id,url,title,summary,text afirika-43986554,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43986554,Akụkọ kachasị n'abalị: Obasanjo akpọpụtala Buhari ọzọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Mpaghara ọdịdaanyanwụ ga-enweta ụgbọelu agha Ọchị agha elu Naịjirịa bụ Air Marshall Sadiq Abubakar ekwela nkwa iziga ụgbọelu agha anọ n'Enugwu. Abubakar kwuru na ụụbọelu ndị ahụ bụ iji chekwaa steei ndị dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa Obasanjo na Buhari Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ bụ naanị ndị bụ onukwu ga-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari emela nnukwu ihe n'obodo a. O kwuru iji gọnarị akụkọ na-agagharị na sọshal midia na Obasanjo na-etozi Buhari na ihe ọ na-arụ. Na mba ofesi Otu mbaụwa bụ UN adọọla aka na ntị ka onyeisiala mba Amerịka ghara ịgbahapụ nkwekọrịta nkwekọrịta ha na mba Iran mere iji kwụsị Iran imepụta ngwọagha nuklia. Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres kwuru na e nwere ike inwe agha mbaụwa ọzọ ma Amerịka pụọ na ya bụ nkwekọrịta Ndị Cambridge Analytica emechiela N'aka nke ọzọ ndị na-enyocha Cambridge analytica ekwuola na ha mechigodi, ọ gaghị akwụsị nyocha a na-eme ha. A na-enyocha Cambridge Analytica maka ebubo izu data gbasara ndị mmadụ na Facebook maka ntuliaka ndị Amerịka mer n'afọ 2016. N'egwuregwu N'egwuregwu otu egwu bọọlụ Liverpool abaala agba ikpeazụ nke asọmpi Champions Lig agbanyeghi na Roma meriri ha. Nke a bụ mbụ ha na-eru n'agba nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi kamgbe afọ 2007. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha. Asambodo gị o na-enye gị nri ? Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-52533424,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52533424,Enyinnaya Abaribe: Ọ bụ Buhari nọ n'Aso villa,Onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị pee mpe na sineti bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola o nweghi onye omeiwu ga-elebanye akwụkwọ iwu ahụ anya rue mgbe coronavirus ga-akwụsị.,"Ọ kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere nke a na-akpọ ""Kwuo Uche gị"", mpkparịtaụka BBC na Sinetọ Abaribe nwere n'ụbọchị nke anọ n'ọnwa Mee. Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na mkparịtaụka ahụ Lee ebe o kwuru ya ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51132415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132415,Ihe i kwesiri ma maka Chioma Uzodinma; nwunye gọvanọ Imo steeti,"Site n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Chioma Uzodinma abụrụla nwunye gọvanọ Imo steeti.","Ọtụtụ ndị ma di ya bụ Hope Uzodinma; bụ onye ọ lụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara nwunye ya nke mbụ alụkwaghịm, mana ụfọdụ amaghị Chioma a bụ onye ga-abụ 'nne mbụ' na steeti ahụ. Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka nwaanyị a. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Etu ụmụnwaanyị Biafra si husie anya n'oge agha" media-46397128,https://www.bbc.com/igbo/media-46397128,Otu nwoke si Enugu-Agu egbuola nna ya n'Enugwu,"Akụkọ dị mkpa N'Enugu,","Ndi uweojii akparala otu nwoke gburu nna ya aka. Ọnụ na-ekwuru uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na Chibuike Nwachukwu ji obeji gbuo nna ya bụ Osita Nwachukwu n'ọnụ ụtụtụ taa n'Enugu-Agu Amuri dị na okpuru ọchịchị Nkanu West. Onye Lebanon bu dọla ọkankụ adabala n'aka uweojii End of Twitter post, 1 Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụ aka bụ EFCC nwụchịkọrọ otu nwoke onye Lebanon maka mpụ bekee kpóró ""money laundering"" n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikwe dị n'Abuja. Nwoke a bu nde dọla, pounds, Euro, Riyal na ego ndị ọzọ ọkankụ o meghi ka gọọmenti mara maka ya aga Lebanon. Onye a malitere njem na Kano. Cheta na ""Money Laundering"" bu mpụ. Na Zamfara, Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ Ndị uweojii ekwuola na ha gburu ndi oji egbe akpa ike karịrị otu nari na anọ . Ihe mere n'obodo Birin-Magaji ụbọchị Tusde. N'ofesi, Ụlọikpe ukwu nke mba Sawụt Afịrịka atụpụla ikpe otu na-anọchite ndị ọcha nwere ala na mba ahụ wetere maka atumatu gọọmentị ha chọro iji napụ ha ala. Gọọmenti onyeisiala Cyril Ramaphosa chọrọ ka ndị ọcha nye ndị isi oji ala na nkiti, makana ha si na ndi ọcha azụghị ala ahụ na mbụ, mana ndị ọcha si ka akwụọ ha ụgwo. N'Egwuregwu, Mmadụ ano si otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nọ na ndi ahụpụtara na ndọrọndọrọ ituru ugo nke CAF na-enye kwa afọ. Mmadụ anọ na Super Falcons na ndị nkuzi otu abụọ a sokwa na ndị nwere ike rite ihe. Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na mmadụ ruru ise anwụọla n'ihe mberede mere n'ụzọ awarawa nke sị Enugu na-aga Abakiliki. N'ime akụkọ ozi onye na-agbasa ozi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Emma Amarizu zipuru ndị ntaakụkọ, ọ kọwara ihe mere oge otu ụgbọala Sienna chọrọ ịgbafe ụgbọala ọzọ na-aga n'iru ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ya na ụgbọala ọzọ akpọrọ tipper na Bekee sụkọtọrọ isi. Amarizu kwuru na ndị uweojii jiri ohere a arịọ ndị mmadụ ka ha nwetuo obi ma ha na-anya ụgbọala n'oge ekeresimesi a. Okwu adaala maka ihe Lai Mohammed gwara ndị Amerika Okwu dara ụzọ abụọ n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ maka ndụmọdụ Lai Mohammed bụ minista mgbasa ozi nyere gọọmentị Amerika ka ha sepuu aka n'inye Atiku Abubakar akwụkwọ ikike ịbata ala ha. Ufọdụ ndị mmadụ na-ekwu na udi emume a na-egosi na Amerika na-akwado sọọsọ Atiku na ntuliaka a. Mana ndị ọzọ na-ekwu na Naịjirịa enweghị ikike ịgwa Amerika onye ha ga-enye akwụkwọ ikike nke ala ha. Onye ndụmọdụ onyeisi oche otu Peoples Democratic Party (PDP) bụ Ike Abonyi gwara BBC Igbo na ndị otu APC ekwesighi ị na-ekwe ka ihe gbasara onyeọzọ ị ga mba ofesi chuo ha ụra. Kama ha gba mbọ hụ na ha doziri obodo Naịjirịa dịka ha si kwe na nkwa. N'ofesi N'ofesi, ọtụtụ ndị mba Amerika na-akatọ onyeisiala ala ha bụ Donald Trump maka akụkọ pụtara na onye bubu onye okwaiwu ya bụ Michael Cohen tụrụ asị oge ọ na-aza ajujụ n'aka ndị ụlọomeiwu nke ala ahụ. Cohen zara ọtụtụ ajujụ maka ebubo ha na-ebo na ndị Rọshịa tinyere aka na ntuliaka Amerika mere na 2016. N'egwuregwu N'egwuregwu, obi na-atọ ndị na-akwado otu Arsenal rịrịrị maka mmeri ha meri Vorskla Poltva ọkpụ atọ asatara ihe n'asọmpị Europa. Cardiff na Wolves bụ ndị ga-ezute onwe ha taa na Premier league. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Vicky Nwogu" afirika-48606143,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48606143,9th Assembly: Ọ dịghị mfe ịchịcha dịka gọvanọ ma bụrụ Sịnetọ - T.A Orji,Sịnetọ T.A. Orji na-anọchite anya mpaghara Abia Central n'ụlọomeiwu sị na ọ dịghị mfe mmadụ ịchịcha dịka gọvanọ steeti ya ma merie kwa n'ịzọ ọkwa sịneti.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Aka chiburu Abia Steeti kwuru na onye gọvanọ ọbụla zọrọ ọkwa sịneti ma merie gosiri na ọ rụrụ ọrụ ya nke oma. Ọ sị na ọ bụ n'ihi nke a mere ndị ebe ha ji sị ya gaa n'ọchite anya ha ọzọ n'ụlọomeiwu. Orji gara n'ihu kpọpụta ihe ndị ọ ga-emere ndị Abia Central dịka onye na-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu nke Naịjirịa. Kirie ihe o kwuru n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46248227,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46248227,"Zik bụ ""ihe"" nye ndị isi ojii - Saraki","N'emume iji cheta Nnamdi Azikiwe ama dịka ""Zik nke Afrịka"" so n'isi a hụrụ kwaba okpu n'ala Naịjirịa nakwa mbaụwa, naanị otutu juru Bukola Saraki ọnụ maka ya.","N'emume ""Zik Lecture Series"" e mere n'Ọka bụ nke asaa, Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa, kwuru na Zik mere ọtụtụ ihe ọma e ji echeta ya. O kwuru na Zik bụ ""Owelle ndị Ọnịcha"" bụ onye anaghị akpa oke ma bụrụ ""ihe"" nye ndị agbụrụ isi ojii. Ihe ise Saraki kwuru Ihe ị kwesịrị ịma maka Zik Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48026247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48026247,Nwoke agbaala nwaanyị na ezinaụlọ ya ọkụ maka ịjụ ya enyi,Akụkọ sepụtara isi n'ụtụtụ a,"Otu nwoke ejirila ọkụ gbagbuo mmadu Asatọ n'otu ezinaụlọ maka na ada ha nwaanyị gbajọrọ ya. Ihe mere n'Okitipupa dị n'Ondo steeti. Nwoke a aha ya bụ Deji Adenuga nọ n'ọsọ ụkwụ erughi ala ugbua. Ndị Sịnetị agbatịala oge itinye aka na Bọdjetị rue izuụka ọzọ Ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Sịneti agbatịala oge itinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2019 rue tuzde ịzuụka ọzọ bụ ụbọchị iri atọ ọnwa Epurelu. Onyeisi ha bụ Bukola Saraki kwuru na akwụkwọ gosiri n'uju echiche mkpata na mmefu a erutebeghi ha aka ma nye iwu ka eme ka o ruo ha aka n'izuụka ọzọ. Nke a kwesiri ịbụ ugboro atọ ha ga-eleba anya n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2019 a. N'aka nke ọzọ, ndị ụlọnnọchite anya n'ụlọomeiwu kwụsịrị nzukọ ha na-eme taa mgbe ndị otu Shiite bu ngagharịiwe bata n'ime gburugburu ụlọomeiwu. Idemmiri egbuola ndị mmadụ na Saụt Afrịka Ihe karịrị mmadụ iri isii anwụọla na mba Saụt Afịrịka mgbe nnukwuu mmiri ozizo butere ide mmiri n'obodo Durban. Mmiri a bidoro zowe n'izu Easter tochiri ụlọ akwụkwọ na ulo ndị mmadụ. A ka na-acho ọtụtu mmadụ. N'egwuregwu Ugo ga-ebere na mgbagbu taa mana amabeghi ma ọ bụ nke Manchester City ka ọ bụ nke Manchester United. Otu abụọ ndị a ga-ezute na Old Trafford taa n'asọmpi Premier League. Ọ bụ ịkparị Igbo ma ọ bụru na enyeghi ọwụwa-anyanwụ oke n'ọchịchi ndị omeiwu Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ Ndị kwuru nke a bụ ndị ntoroọbịa ọhaneze ka ha na-adụ pati na-achị Naịjirịa bụ APC ọdụ maka nhọpụta ndị ga-achị ụlọomeiwu nke itoolu. Dọkinta Kingsley Dozie bụ osote onyeisi ndị ntoroọbịa Ohaneze bu onye kwuru nke a n'Owere. O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-awụchi Legọs taa Buhari na-abịa ịgbape ụzọ ọhụrụ, ụgbọala BRT nakwa ụlọ ifo gọọmentị aka na-achi Legọs bụ Akinwumi Ambode hibere agbanyeghị na-arụchabeghị ụfọdụ n'ime ha. N'ofesi, Aka na-achị mba Nọt Korea bụ Kim Jong-Un nọ na njem ịga hụ onyeisiala Rusia bụ Vladimir Putin na obodo Vladivostok. Maazị Kim ji ụgbọoloko nke ya aga nzukọ a ga-abụ nke mbụ ya na Putin ga-enwe. N'egwuregwu, Ọnu dị ndị otu egwuregwu Barcelona sọsọ ọchị ka ha ji ọkpụ abuo asataghi ihe ọbụla sị Alaves 'mechie ọnụ' mgbe ha zutere ụnyaahụ. Mmeri a nyere Barcelona ohere ịkwụsi ike n'ịzọ iko La Liga." afirika-48274070,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48274070,Igbo Origin: Aguleri maọbụ Nri olee ebe ndị Igbo si?,N'ihe nkiri a bụ ebe nrụrịtaụka bịara n'isi ngwụcha.,"Mgbe BBC Igbo gara obodo Aguleri na obodo Nri iji mata isi okwu ndọrọndọrọ a, lekwa ihe ha hụrụ? N'agba nke a, ndi Aguleri na ndị Nri tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Gee ha ntị ka ị mara ndị ya bụ okwu bere n'ọnụ. Akụkọ ga-amasị gị:" 42814499,https://www.bbc.com/igbo/42814499,Ụgbọ Oloko kopuru ma gbuo mmadu abuo na Milan nke mba Italy,Ụgbo oloko bu mmadụ kopuru n'okporo ya mgbe n'ụzọ Milan wee gbuo mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ ruru otu narị ahụ.,"Amabeghi ihe mere ụgbọ oloko a jiri kopu Ndi na agbanyụ ọkụ na agba mbọ ịzọpụta ọtụtụ mmadụ tọọrọ na ime ụgbọ oloko ahụ. Ihe mberede a mere na ụzọ ụlọ ụgbọ oloko dị na mpahara Italy na-akpọ Treviliglio na Pioltello, dịka ụlọ nta akụkọ Rai news kọwara. Mmadụ iri merụrụ nnụkwụ ahụ ebe ndị mmadụ karịrị otu narị nọ na ụgbọ oloko a mgbe ihe a mere. Ụgbọ Trenorda a si Cremona, nọ na ụgwụ Italy, na-aga Milan. A mabeghị ihe kpatara ụgbọ a jiri kopu. Mkopu a mere na elekere asatọ nke ụtụtụ taa. Nkopu a mere na gbụrụgburu Milan" afirika-51338296,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51338296,Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ',Nwada Blessing Faith Onyemaucheya bụ onye na-agba bọọlụ kọwara etu o si malite iji iko bọọlụ enyere onwe ya aka n'ụlọakwụkwọ.,"Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ịgba bọọlụ mgbe ọ dị na nwata, nna ya na-akpọ ya a ga-ekiri bọọlụ. Dịka o tolitere, ọ malitere gbawa bọọlụ mana o nwebeghi ohere ịgba ya ruo ebe ọ ga-enye ya ego. Nke a mere o jiri malite iko bọọlụ iji mee ndị mmadụ obiụtọ ma na-enwete ego na ya. Blessing agakwala ọtụtụ asọmpi iko bọọlụ ma rite nturuugo dị iche iche. Kirie ihe o kwuru n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49055444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49055444,Crime fighting: Nwaagboghọ a sị na ọ bụ 'oji egbe ezu' abanyela n'akpa ndị uweojii,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtu a,"Maka nwaagbọghọ oji egbe ezu Aka ndị uweojii akparala nwaagbọghọ onye a na-eche na ọ bụ onye oji egbe ezu n'Eziowelle, Idemili North n'Anambra Steeti. Onye gbara ama a bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed bụ onye sị na o teela ya bụ nwaagbọghọ mewere ndị ogbe ha ụra adị n'anya. Maka ndị omekome na Kastina steeti Echere na ọ bụ ndị agboro na-agba egbe a Akụkọ na-eru anyị ntị na Kastina steeti na-ekwu na ndị omekome awakpola ma zuo ihe ndị mmadụ na Danbirgima dị na okpuruọchịchị Kankara. Gambo Isah bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii na steeti ahụ sị onweghị onye egburu na ya bụ mwakpọ ruchara awa abụọ. Egbe ọnụ Briten na Iran N'ofesi e, Jeremy Hunt bụ odeakwụkwọ ukwu mba Briten ekwuola na ha anaghị eche echiche ọgụ n'ikpezi okwu ụgbọmmiri ha abụọ a na-ebo mba Iran ịkpachi. Hunt sị mana ọ bụrụ na Iran ahapụghị ụgbọmmiri ahụ ngwangwa na ha ga-ata aka n'eze mgbe adịghị anya. Uwa agba Romelu Lukaku gharị Romelu Lukaku ebe o tukwu n'oche mgbe Manchester United na Inter Milan kwatara ya na Singapore n'ọnwa Julaị 2019 N'egwuruegwu, nke na-akpọtụ ugbua bụ na Manchester United ajụla nde Naịra iri isii Inter Milan ji chọọ ịzụrụ Romelu Lukaku. Ha sị na o rughị ọnụego egoro ya. Gee akụkọ BBC Igbo ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ohere enyere Atiku ịkpọ akaebe agafeela Ndị zọrọ ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa na osote ya n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP) bụ Atiku Abubakar na Peter Obi, ewetachaala ihe ndị ụlọikpe chọrọ n'aka ha dịka ha na-agba Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ maka ntụlịaka e mere n'afọ 2019 a. Ha kpọtara ndị akaebe 62 n'ime 400 ha kwuburu na ha ga-akpọta. Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụzị ndị Independent National Electoral Commission (Inec), All Progressives Congress (APC) na Buhari ga-akpọta ndị akaebe nke ha ga-eji zara ọnụ ha n'ụlọikpe. Otu n'ime ndị PDP kpọrọ bụ Osita Chidoka, bụ onye bụbụ Minista na-ahụ maka njem nakwa onyeisi ndị ọrụ nchekwa njem. Chidoka kwuru ihe ọ ma dịka onye so rụọ ọrụ banyere ntụliaka n'ogige PDP. Mba Briten adọọla Iran aka na ntị maka ụgbọmmiri ha Ndị mba Briten na-eche oke echiche banyere etu ndị mba Ịran si kpachie otu ụgbọmmiri ha a kpọrọ Stena Impero maka ""ịda iwu ndị mba nke metụtara njem osimiri"". Onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na mba ndị ọzọ bụ Jeremy Hunt, dọrọ aka ntị hoo haa na ihe na-adịghị mma ga-eme ma ọ bụrụ na ha emezighi ihe ha mebiri ọsịsọ. N'egwuregwu, Ndị mba Senegal bu aka n'isi na-eti okokoko ka ndị Ọljiria gbawara ha aka Iko Mba Afrịka nke afọ a. Ọljiria ji naanị otu ọkpụ goolu e nyere n'ime nkeji abụọ e ji malite egwu ikpeazụ wee bute iko aka ha emetụbeghi n'afọ iri abụọ na itoolu. Gụọ maka mmeri ha n'uju ebe a: Senegal alụchaala ọgụ Algeria enwere akụkọ Gee nkeji BBC ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ụmụ nwoke na-enye m nsogbu mana adịghị ege ha ntị - Agbọghọ na-ere Abacha" egwuregwu-48739405,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48739405,"Women's World Cup 2019: Afrịka, ka emesia",Ndị mba Inglandị e jiri la okpụ gool atọ asataghị ma otu were memilaa olileanya ndi Afrịka nwere mgbe ha na Cameroon zutere n'ubochị taa.,"Kamerun ji nkata kporo goolu a n'aka Houghton na nkeji 14, White na nkeji 45+4 nakwa Greenwood na nkeji 58. Kamerun nwara ike ha ịsata goolu ndị a mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Otu abụọ a zutere onwe ha na Valenciennes i ji mara ndị ga abanye agba nke atọ na asọmpị a. Cheta kwa na ndị otu egwuregwu Cameroon nyere otu gool ma VAR kagburu ya si na ọ bụ 'Off side' . Mmmeri mba Ingland meriri Cameroon agbapụla mba Afrịka niile kpọm kwem n'asọmpị iko Mbaụwa ụmụnwaanyị." afirika-45662701,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45662701,Imo State: Ihe kpatara anyị gbagharịa Madumere akwụkwọ,Gọọmenti Imo steeti ekwuola ihe mere ha ji aga ụlọikpe mkpegharị ịgbagha mkpebi e kpebiri iweghachite Eze Madumere dịka osote gọvanọ steeti ahụ.,"Onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo, kwuru na ụlọikpe ahụ arụtụghị aka n'ebubo e boro Madumere e jiri chutuo ya, kama, ọkaikpe metụrụ aka naanị na ndị e kpokobara mere nyocha maka nchutu ahụ. O kwuru na Okorocha enweghị ihe ọbụla o nwere megide Madumere maọbụ ọkaikpe kpere ikpe ahụ, kama na ọ bụ usoro iwu ka ha na-eso. N'okwu ya, ""Ọkaikpe ahụ kwuru na onyeisi oche e jiri kpee ikpe maka nyocha ebubo e boro Eze Madumere gafere oge e nyere mana o kwughi okwu gbasara ebubo e boro Madumere."" ""Ndị na-eme mkpegharị a bụ ndị ikpe ahụ metụtara, gọvanọ Okorocha esoghi na ya dịka mmadụ." afirika-48583000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48583000,Etu anwụrụ igwe na-enye ọkụ siri gbuo mmadụ isii gara ịgbankwu n'Imo - Ndị uweojii,"Mmadụ isii nọ n'ụlọ a nọ gbaa nkwụ nwaanyị n'Ụmụeze ndị n'Ụmụọmụmụ nke Mbieri dị n'okpuruọchịchị Mbaitoli nke Imo steeti, alaala mmụọ site n'anwụrụọkụ igwe na-enye ọkụ e busara n'ime ụlọ.","Ihe Godson Ikeokwu kwuru maka ọdachị mere na Mbieri Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu, gwara BBC Igbo na ọ bụ ụnyaahụ bụ ụbọchị nke itoolu n'ọnwa Juun ka a gbara nkwụ nwaanyị ọdachị a sotere. ""Ọ bụ n'ụtụtụ a ka otu nwoke aha ya bu Herbert Uzoegbu bu onye Ụmụeze Mbieri, gara ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mbieri gaa gwa ha na ya gara be nwanne ya nwoke ha nọ gbachaa nkwụ nwaanyị ụnyaahụ n'ụtụtụ mana ka ọ hụrụ na onwebeghi onye kuliri, o were lawa. ""Ka ọ kụrụ elekere asaa, ọ laghachị ma hụkwa na onwebeghi onye pụtara, nke mere o jiri kpọwa n'ekwentị. Ka mmadụ asaghị ya, o wee gbakaa ụzọ, hụ ka ndị niile nọ n'ụlọ ahụ tọgbọ ka ha anwụrụ anwụ."" Ikeokwu gara n'ihu gwa BBC Igbo na-eburu ndị nọ n'ime ya bụ ụlo ruru mmadụ iri abụọ n'itoolu gawa ụlọọgwụ, ebe ndị dọkịnta kpebiri na mmadụ isii anwụọla. Ọ sị na mmadụ iri abụọ na atọ ka nọ na-agba mgba ọnwụ na ndụ. Theresa Onyekaiheya bụ onye Mbieri gwara BBC Igbo na ọ bụ mmadụ iri ka ya ma nwụrụ n'ọdachị a, ma na-ekwukwa na akukọ na-ekwu na ndị nwụrụ karịrị. Gee ọnụ Onyekaiheya ebe a. Ihe anya hụrụ gwara BBC Igbo maka ọdachị Mbieri Agbanyeghị na Ekeokwu kwuru na ha ka na-eme nchopụta maka ihe a mere, mana o kwukwara na ahụrụ igwe na-enye ọkụ latrik n'ime ụlọ ahụ. Igwe na-enye ọkụ latrik na-emepụta anwụrụ Bekee kpọrọ ""Carbon Monoxide"" bụ ihe na-egbu mmadụ, ọkachasị ma ya bụrụ na ọ dị n'ime ụlọ." afirika-43580152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43580152,Akụkọ kachasi taa: RMAFC ekwuola ka ndị sineti akọwa ego ha,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Taa bụ gud Fraidee ụbọchị a na-echeta ogbugbu Kraistị maka ndị ụka Kraistị. Mmemme Ista asarala ọkụ n'ebe dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjira ebe ụka dị icheiche na-eme mmemme ahụ n'ụdị nke ha. Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụka Kraistị niile ka ha kwụsị okwu akpọmasị, mpụ na ajọ ihe ndị ọzọ niile. N'ozi Buhari zigara ndị ụka Christ ụnyaahụ dịka a na-akwado mmemme Ista, o kwuru ka ha ṅomie Kraistị n'agwa ya niile dịka ndị na-eso ya. RMAFC ekwuola na ndị sineti ga-akọwa ebe ego ha si. Otu na-ahụ maka ikesa ego na Naịjiria a na-akpọ Revenue Mobilisation Allocation and Fiscal Commission, RMAFC, n'aha ịchafụ ekwuola na ha amaghị ka ego ndị sinetọ na-eri si ruo nde naịra iri na atọ na ụma. Ha kwuru na ego ndị sineto kwesiri iri kwa ọnwa bụ naanị otu nde. N'egwuregwu Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa agụpụtụla ndị referii mmadụ isii ga-arụ ọrụ n'asọmpi iko mbaụwa. Ndị referii a, ga-enwe referii mmadụ iri si mpaghara Afrịka ga-abụ osote ha mana onweghị onye Naịjiria banyere ya. Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ị bụụla onye isi nkwọcha n'oge erughi eru, lee ihe nwere ike ịkpata ya. Ị bụrụla onyeisi nkwọcha? Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa" afirika-44890385,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44890385,Mpụ na aghụghọ adọbala ụmụafọ Naịjirịa ise n'ụlọikpe na Kenya,Ndị uweojii na mba Kenya akpụpụla ụmụafọ Naịjirịa ruru ise ụlọịkpe taa bụ tọọsde maka ịzara ọnụ ha n' ebubo mpụ a kpọrọ 'Sim swap scam' na bekee.,"Ụmụ afọ Naịjirịa akpụpụrụ ụlọikpe na Kenya Ego ha zuru n'aka ndị mmadụ ruru ọtụtụ puku shillings n'ọnụọgụgụ ego ndị mba Kenya. Safaricom bụ ụlọọrụ ekwentị amaama na Kenya bụ ndị nke a kachasị metụta. Dịka Sammy bụ otu onye na-eji safaricom akpọ ekwenti kọrọ ahụmihe ya na soshal midia. Ọ sị na ndị a na-aghọ aghụghọ a kpọrọ n'elu ekwentị ọ zaa, mgbe o doghị ya anya ọ malitere ịkwụsị oku ahụ. O mekwara ngwangwa kọwara ndị Safaricom tupu e si ebe ahụ zuru ego ya. Ndị uweojii na-enyocha okwu a kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị mba Kenya na-enyere ha aka n'ime mpụ. Mba Kenya bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ihe akpọrọ 'Mobile money' akwụ ụgwọ ihe dị icheiche." afirika-44827957,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44827957,Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ: Okezie Ikpeazu ekeleela Amaju Pinnick,Isiokwu ndị dị mkpa na mgbede a,"SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria Ụmụ afọ Igbo ruru asatọ so na ndị e bulitere n'ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ 'Senior Advocates of Nigeria (SAN).' Ha bụ George Igbokwe, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, Abuchi Madu,Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo. Ndị na-azụ ahịa enwela mmeri taa. Steeti ndị ahụ kwuru na iwu na-ekewa ezinaụlọ megidere iwu ala ha bụ 'Constitution' Ụlọịkpe n'Abuja amanyela iwu ka-ewugharịa ọdọ ahịa ndị gọọmentị obodo ahụ kwaturu n'ụlọahịa Karmo n'Abuja. Ndị ihe a metụtara kpụpụrụ ngalaba na-ahụ maka Abuja nakwa minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa kemgbe 2011 maka nkwatu a mere n'afọ 2006. #Ekitidecides Dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Ekiti steeti echi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụfọdụ ngalaba gọọmentị dị ịcheiche agbachiela n'oge. Ọge ọchịchị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Ayodele Fayose ga-ebi echi mgbe a họpụtara onye ga-anọchị anya ya. N'akụkọ ofesi, N Logeswari bụ nwataakwụkwọ nwụrụ mgbe a kwara ya aka Ndị uweojii na mba India anwụchiela otu onye nkuzi kwara nwataakwụkwọ ya aka o we siri n'elu ụlọ dapụ nwụọ. N Longeshwari bụ aha nwata ahụ na-atụ egwu isi n'elu ụlọ ahụ wutuo mgbe ha na-eme ọzụzụ nchekwa tupu onye nkuzi ahụ kwaa ya aka. N'egwuregwu, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enyela Amaju Pinnick ekele pụrụịche maka ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka osote onyeisi CAF Cheta na achụrụ Amaju Pinnick n'ọrụ dịka onyeisi ngalaba egwuregwu bọọlụ nke Naịjirịa n'ụbọchị ole na ole gara aga. Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Gụọ ya ebe a: Dịka ala, agwọ eke bụ onyeozi ọtụtụ ofeke mmụọ Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Gee nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-52708247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52708247,Coronavirus in Nigeria: Kedu ihe mere na ndị mmadụ anaghị anwụ n'Afrịka dịka e sibu gba n'ama?,Afrịka aghọọla osisi a tụrụ anya ọdịda nke dị ndụ n'okwu gbasara mkpamkpa coronavirus na-akpa n'ụwa gba gburugburu.,"N'ụbọchị iri nke ọnwa Eprel afọ 2020 ka nwunye onye bidoro ụlọọrụ Microsoft bụ Melinda Gates kwuru sị na, ""etu ozu ndị mmadụ sị dọrọ n'ụzọ na mba Ecuardo etu ahụ ka ọ ga-adị n'Afrịka"" Ọ sịrị na "" Ihe mere na ọnụọgụgụ ndị mmadụ bụ Covid-19 n'Afrịka ebughị ibu bụ maka na ha enweghị ihe nnyocha ebe ọ bara ụba."" N'otu aka ahụ, n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Eprel, 2020, ka ngalaba na-ahụ maka ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organisation' kwuru na n'ime ọnwa atọ maọbụ isii na ndị ga-ebute ọrịa coronavirus n'Afrịka ga-erute nde iri. O ruola otu ọnwa Gate kwuru okwu a kama ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na mba mepere emepe dịka Amerịka, Briten, na ndị ọzọ biaziri karịa nke Afrịka niile kemgbe ọrịa coronavirus bidoro. Onyeisi ngalaba WHO na-ahụ maka gbatagbata bụ Michel Yao kwuru na nke a nwere ike ọgaghi emezu were kwuo na n'oge ọrịa Ebola, na Afrịka meriri ya bụ ọrịa dịka mmadụ niile mere ihe ha kwesiri ime. Dịka ọ dị ugbua, na agbanyeghị ọrịa na ọnwụ na-akpọtụ na mba ndị mepere emepe, ndị nwụrụ n'Afrịka erughị ihe ha tụrụ anya. Ngụkọ WHO nke mpaghara Afrịka wepụtara gosiri na n'abalị iri abụọ nke ọnwa Mee afọ 2020(20/5/2020), mmadụ 90 ebutela ọrịa coronavirus n'Afrịka, ebe mmadụ 2885 bụ ndị nwụọrọla. Lee ogogo ebe ọrịa coronavirus kachasị na mba dị na Yurop na Amerịka taa bụ Mee 20,2020 Lee ihe na-egosi etu coronavirus si kwụrụ na mba ndị mepere emepe na ndị ka na-emepe emepe ọkachasị n'Afrịka Ọnụọgụgụ ndị a na-egosi na mba ndị mepere emepe nwere ọtụtụ ndị bu ọrịa coronavirus na-agbanyeghị na ha nwere ngalaba ahụike dị mma karịa nke dị na mba ndị na-emepe emepe. Iji mara ihe dị iche na egbe na egbe, anyị kpọtụrụ ndi ọkammụta n'ihe gbasara ahụike ọha iji mata ihe na-etiri Afrịka egwu ha na-agba ka o si gbasa coronavirus, ha rụtụrụ aka n'ọtụtụ ihe gụnyere nchekwa ahụ ndị Afrịka nwere, ogwu mgbochi ha nwetaburu, afọ ole ndị nọ n'afrịka gbagara wdg. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwuru: 1. Ọgwụ mgbochi (Immunization) Dkta Bond Anyaehie kọwara na otu ihe dịpụrụ iche ha chọpụtara bụ na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus n'ebe ndị agbara ọgwụ mgbochi ọrịa pere mpe ma atụnyere ya n'ebe ndị ọzọ. Ọ mara atụ were sị na n'Ọwụwa Anyanwụ na ndị bu ya bụ ọrịa pere mpe ma a tụnyere ya ndị bị na mpaghara Ugwu. Anyaehie chere na nke a nwere ike ịbụ ihe mere ga ndị bi n'Ọwụwa anyanwụ nwee nchekwa ahụ e ji alụso ọrịa ọgụ nke siri ike. 2. Mgbe ọrịa batara Afrịka Dkta Ikenna Onoh kọwara na ka ndị mmadụ cheta kwa na ọrịa ka batakwara abata. Nke mere n'Afrịka ka nọ na mbido ọrịa a zurula ụwa ọnụ. 3. Etu ahụ ndị Afrịka sị alụsọ nje ọgụ ( Immune System) Anyaehie kọwara na e nwekwara ike ọ bụrụ na ahụ ndị Afrịka nwere ihe eji alụsọ ọrịa ọgụ n'ihi na ahụ ndị Afrịka na-emetụkarị nje nke mere ka ahụ ha gbasie ike karịa nke dị nọ ofesi. 4. Afrịka nwere ndị ntorobia n'uju Nchọpụta na-egosi na ndị coronavirus na egbukarị bụ ndị gbaliterela n'afọ., ndị dị afọ 60 were gbagowe. WHO kwuru na ihe karịrị paasent 95 na-anwụ site na coronavirụs bụ ndị karịrrịala afọ 60. Ihe karịrị pasent 50 ndị nwụrụ na Yurop gbara afọ 80. Na nkọwa ya, Dkta Ikenna Onoh kwuru na ndị mba nọ n'Afrịka kachasị ndị mba mepere emepe nwee ndị ntorobia, ebe mba dịka Amerịka ka mba n'Afrịka nwee ndị okenye. O kwuru na nke a nwekwara ike ime ka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ karịa na mba ndị a. 5. Etu ndị Afrịka ọkachasị Naijirịa si aṅụ ọgwụ Anyaehie kwukwara na-enwereike, etu ndị Afrịka ọkachasị Naijirịa sị aṅụ ọgwụ nwereike i so n'ihe mere ka ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa pee mpe. Ọ mara atụ sị na ""Onye na-arịa ọrịa na Naijirịa na-agakarị ""Chemist"" azụta ọgwụ, ọkachasị ugbu a na-ekwu na ọgwụ ""Chloroquine"" na-enyere aka."" Ọ kọwara nke a nwereike ibute na ọgwụgwụ nwereike ị na-eme n'ụfọdụ ebe mana onweghị onye ma. 6. Ebe ahụ igwe mmadụ na-alụso coronavirus ọgụ (Herd Immunity) 'Herd Immunity' bụ mgbe ọtụtụ mmadụ n'ime igwe nwetarala nchekwa ahụ megide ọrịa na-efe efe. Ọ bụrụ na ihe ruru pasent 80 n'ime igwe mmadụ ahụ nwere ọdaeshi ime ahụ nke na ọ bụrụ na mmadụ anọ n'ime ise ha zute onye bụ ọrịa ahụ, ọ gaghị enwetali ha. Anyaehie kwuru na-enwereike ọ bụrụ na ahụ ndị Afrịka esiele ike ma nwee ike imegide ya bụ ọrịa nke nwereike ime na mmadụ ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọgaghị ama. Gịnị bụ 'herd immunity'? 7. Mmadụ ole emerelannyocha Onoh kwuru na ọtụtụ mba nọ n'Afrịka enweghị ndị na-enye aka achọpụta ndị bu ọrịa coronavirus nke a na-akpọ ""Public Health Survelilance"". O kwuru sị ""Anyị nwere ike ị na-edufu onwe anyị na-eche na ndị bu ọrịa a pere mpe, mana dịka anyị enweghị ụzọ nchọpụta, nke a nwere ike ị bụ asị"". Bond Anyaehie tinyere ọnụ sị na nsogbụ ọzọ bụ na ndị mmadụ anaghị abịa ka enyocha ha ma ọ bụrụ na ha na-egosi njirimara coronavirus. O kwuru na ọkachasị njọ na mpaghara ụgwụ ebe o siri ike irute ndị nọ n'ime obodo. Ọ mara atụ sị na n'ebe dịka Kano ebe enwereike inyocha mmadụ otu puku kwa ụbọchị mana enweghị onye na-abịa. 8. Ọnọdụ ihu mbaraigwe Afrịka A ka na-agbagha na ọnọdụ mbaraigwe e nwere ike imetụta etu coronavirus si ekesa maọbụ na-akpa ike Otu nchọpụta e mere gosiri na mba ndị ọrịa na-akpa ike site nkesa n'obodo kacha nwe ndị butere ọrịa karia ndị bi mba ọnọdụ ihuigwe ha gbalitere. Nchọpụta ọzọ lere anya na obodo 100 dị na mba Chaina nwekarịrị mmadụ karịrị 40 butere ọrịa na ebe ọbụla ekpomokụ kacha dị, n'ọrịa ahụ anaghị aba ụba. Ndị nchọpụta si 'University College London (UCL) na London School of Hygiene and Tropical Medicine n chọpụtara na e nwere ihe ịgba ama na nje coronaviruses na-ekesakarị n'oge winta. I lee anya Afrịka nwere ọtụtụ mba ekpomokụ na-adịkarị mana ndị ọkammụta ekwubibeghị okwu na nke a so n'ihe mere n'ọrịa anaghị efe maọbụ na egbu nyụghụ nyụghụ ka o si eme na mba ndị ọcha. Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus ọ ga-agbago? Ikenna Onoh kwuru na e nwere ike ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa cornavirus agbagoola ma anyi amaghi n'ihi na ha nwere ike ị na-anwụ ebe dị iche iche. Ọ kọwara na o nwereike ịgbago n'ihi na ọrịa ka batara Afrịka ma e jiri mba ofesi tulee ya. Onoh kwuru na oge ọ batara Naijirịa na gọọmentị na-achọ ịchọpụta ndị si ofesi bata(imported cases) na ndị ha na ha nwere mmekọ mana ugbua, ọ banyela n'obodo(community transmission.) Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-57003992,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57003992,Killing of Twins: Ụmụ ejima atọ kọrọ etu e si zọọ ndụ ha mgbe a na-egbu ejima n'ala Igbo,Ị ma na omenala Igbo n'oge gboo nyere ka egbuo ejima na ejima atọ n'ọmụmụ?,Mana o nwekwara ndị ezopuru anwụghị mgbe ahụ. Ụmụnne abụọ a gbara afọ iri asatọ na ato (83) nyara ndụ mgbe a na-egbu ejima n'ala Igbo. Gee akụkọ ha n'uju ebe a. afirika-48381488,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48381488,Football talent 419: Ihe ụmụntoroọbịa ma agba bọọlụ na-agabiga,Ụmụaka Chukwu nyere onyinye ịgba bọọlụ kwesiri ịlafere ụbịam banyere n'aka ndị omekome ji ha mere nri.,Ọtụtụ n'ime ha efuola ụzọ n'aka ndị ọjọọ a. Sunday 'Supremo' Chukwu so na ndị ọgba bọọlụ n'Enugwu na-enye ndị ntoroọbịa aka tupu ọ nwụọ Ọtụtụ nne na nna etinyela akụ na ụba ha n'isi ụmụaka ha Chukwu nyere onyinye mana isi apụtaghị na ya bụ mbo ha gbara. Ihe nkiri a gosiri ọtụtụ ihe ụmụaka ndị a na-agabiga. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 53501821,https://www.bbc.com/igbo/53501821,Ihe i kwesiri ịma tupu i yiwe 'waist trainers',Nke na-ewuru ụmụnwaanyị kamgbe ụwa bụ inwe ahụ dịka ịkọ mmanya nke a kpọrọ 'hours glass' na Bekee.,"Ya bụ afọ tara ata, ara buru ebu na ukwu dọnyere adọnye kpọmkwem. I nwee nke a, ị mara na i chizugo, bụrụzie olu gbajie ihe ọbụla nwere olu. Ụdị ahụ a abụghị taa ka ọ malitere iwuru ụmụnwaanyị, mana ụzọ e si aga Ọnịcha dịghịghịkwanụ nso cha cha. Ngala ụmụnwaanyị na-akarị akarị ma ha nwee ụdịrị ahụ mere ọtụtụ ji eforo ntutu taa ime ihe ọbụla ọ ga-eri iji nweta ahụ iko mmanya. Mana ya bụ okwu inwetakwanụ afọ tara ata abụghị ugbo a na-aga ma e bughi mmiri maka na ụdị ahụ ndị Afịrịka nwere na-echere ha aka dị egwu, ọ na-arịa ahụ nke ukwuu ọkachasị maọbụrụ na nwaanyị amụọla nwa. Nke a kpatara ha jiri malite iṅomi ihe ụmụnwaanyị ndị ọcha na-eme na ihe ha na-eyi iji nweta afọ tara ata nke a kpọrọ ""Corsets"" na Bekee. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a ma ama dịka Beyonce, Kim Kardashian na-eyikwa ya ma na-egosi ya na soshal midia. Ya mere ọtụtụ ụmụnwaanyị ji na-eyikwa ya bụ ihe nakwa nke a na-akpọ ""Waist Trainers"" bụ nke ị ga-eyi ma ị na-emegharị ahụ iji hazie afọ gị mee ka ọ baa n'ime. Mana ajụjụ dị mkpa ịjụ bụ, ọ bụ naanị inweta afọ tara ata, kedụkwanụ maka ahụike nwaanyị na-eyi ihe ndị a? O nwere ihe ọ na-eme n'ahụ ya ka ọ dị mma iyiri na-aga? BBC Igbo buru ajụjụ ndị a bugara Dọkịnta na-ahụ maka ahụike ahụ ụmụnwaanyị bụ Chidiebele Ojukwu. Ọ gwara BBC Igbo na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-eso iyi ya bụ ihe nke na-emegide ahụ nwaanyị n'ụzọ dị icheiche mana ụmụnwaanyị amaghị. Ihe ise iyi 'corset' na 'waist trainer' na-eme n'ahụ nwaanyị. 1. Ọ na-afịkọ ihe dị n'ime ahụ nwaanyị dịka eriri afọ Dịka dọkinta Ojukwu siri kwuo, etu ""Corset"" ebuba afọ mmadụ ime bụ na ọ na-afịkọ akwara afọ mmadụ ma jide ihe ndị dị n'ime afọ dịka eriri afọ na ihe ndị ọzọ kekọsịa ma bụgharịa ya ebe ha kwesiri idị. Ya bụ o si ebe eriri afọ kwesiri ịdi, bụgharịa ya maka na ohere adịghịzi ịnabata ebe ọ ga-anọ. Nke a nwereike ibute nsogbu dị icheiche so egwerighi nri nke ọma n'afọ mmadụ ga-ebute nsogbu afọ dị icheiche. 2. O nwereike imetụta akụkụ ahụ dị n'ukwu nwaanyị nke a kpọrọ 'pelvic organ' na Bekee. Ụfọdụ akụkụ ahụ ndị a bụ akpa nwa, akpa mamịrị na ndị ọzọ. Oge nwaanyị yiri 'Corset', ọ ga-agbalite ndagide dị n'ime afọ ya nke ga na-ebudata akụkụ ahụ ndị ahụ dị ya n'ukwu n'ala nwereike ibute ihe a kpọrọ 'hermarhroids' na 'prolapse' na Bekee bụ ebe akpanwa si n'ikpu nwaanyị na-adapụta. Etu ime ahụ onye yiri 'waist trainer sị adị' 3. O nwereike ibute maamịrị ịdapụ nwaanyị n'ike. Nwaanyị ji kọsetị ekechi afọ ya oge ọbụla na adagide akwara ndị dị n'ukwu ya ma n'afọ ya dịka Dọkịnta Ojukwu siri kwuo nke bụ na akwara ndị ahụ agaghị esizi ike nke ọma bụ na ọ chị a ọchị, maamịrị adapụta maọbụ na ọ gaghị akpadoli ahụ ma o jide ya. 4. Ọ na-eme ka afọ yọọ ayọ. Akwara ndị dị n'afọ na-esi ike n'onwe ma na-adọtị na-adọbakwa n'akwa ya na-eye aka ikwagide azụ mmadụ na etu mmadụ si kwụrụ. Mana oge nwaanyị jiri kọsetị kedo afọ ya, kama afọ ya ịrụ ọrụ ahụ, kọsetị ahụ ga na-arụ ya nke ga-eme na afọ ya ga-anọzi nkịtị, oge ọ kwụsịrị iyi ya, afọ ya aƴọ ayọ maọbụ ọ malite inwe azụ mgbu. N'okwu Dọkịnta Ojukwu: ""Ụfọdụ ụmụnwaanyị bụ ha yipu 'waist trainer' ha si hee!, afọ m atagọkwa mana afọ gị atago, gịnị ga-emezi ihe ndị nọ gị n'ime afọ? Nwaanyị mụrụ yichaa kọsetị, ọ dị ime ọzọ, afọ ya ga-emepekwa karịa maka na afọ ya esighi ike ịrụ ọrụ imechi ya, kama ọ bụ kọsetị rụrụ ọrụ ahụ."" 5.Ọ na-enye nsogbu n'iku ime: N'okwu Dkt. Ojukwu; ""Onye yi kọsetị anaghị ekuta ume nke ọma"". Oge mmadụ na-eku ume, akwara ndị nọ n'afọ kwesiri ijiri aka ya na-adọtị na-adọbakwa, i kuo ume, afọ gị ebuo ibu nweeike nabata ikuku, i kupu ume, ọ taa, kupu ajọ ikuku. Mana i yiri kọsetị, afọ gị agaghị agbasa nke ọma ga-eme na ọ gaghị anabata ikuku nke ọma ma kupukwa ajọ ikuku nọ gị n'afọ makana kọsetị jikwara ya. Nke a nwereike ibute ọtụtụ nsogbu n'ime ahụ mmadụ. Dọkịnta Ojukwu kwuru: ""I lechaa ụdị ihe a anya, kedụ ka ị ga-esi gwa mmadụ ya yiri 'Waist trainer"" na-emegharị ahụ bụ mgbe o kwesiri ikumi ume ekumi maka ahụ ọ na-emegharị?"" O kwuru na oge mmadụ na anaghị eute ume nke ọma, ime ahụ ya agaghị enwetacha ezigbo ikuku. 6. Ọ bụrụ na akwara afọ gị ayọ ayọ ọ ga-emetụta akwara ukwu gị nke ga-emetụta etu i si enwe aramara. Akwara ndị a dị n'ukwu nwaanyị bụ ihe gbara ikpu ya gburugburu na-eme na ọ bụrụ na o siri ike, ọ ga-ejikwa onwe ya nke ọma mana onye na-eyi kọsetị akwara ukwu ya yọrọ ayọ, ọ ga-eme ka akwara ikpu ya yọọkwa ayọ bụ na ikpu ya ga na-aga siriri werere. Ọ gaghị ejikwata amụ nke ọma, dịka Dkt Ojukwu siri kwuo. Ọ bụrụ na ikpu nwaanyị dịka ọmị, obi agaghị adị ma ya ma nwoke ya mma cha cha maka na aramara ha agaghị adị ụtọ etu o kwesiri. Akwara nke a na-enyekwa aka ka nwaanyị nwee nke a kpọrọ 'orgasm' maka na ọ bụ ya ga na-akwakọ ọnụ ma nwaanyị nwee 'orgasm'. Nwaanyị ọ ga-eyili kọseti chacha? Dkt Ojukwu kwuru na nwaanyị nwereike iyi kọsetị n'ime akwa ya iji nye ya ụdị ahụ ahụ ọ chọrọ mana ọ gaghị eyi ya ogologo oge maka na nsogbu so ya n'ọdịnaihu karịri akarị. Ọ bụrụkwa na i nwere nsogbu dịka ejikwaghị maamịrị, i kwesighi iyi ya cha cha dịka Dkt Ojukwu siri kwuo. Onye na-emegharị ahụ ekwesighikwa iyi ya cha cha, jiri aka gị rụọ ọrụ n'akwara afọ gị ka ọ gbasie ike, jikwa gị nke ọma. Nwaanyị mụrụ nwa o kwesiri iyi ya? Dọkịnta Ojukwu kwuru na nwaanyị mụrụ nwa ekwesighi iyi ya maka na ọ bụghị naanị maka ibuba afọ, o kwesikwara ile anya maka ahụike ya. Nwaanyị mụrụ nwa, afọ ya adọsala adọsa maka afọ ime. Akwara ukwu ya ma akpa nwa ya gbaturu agbatu maka nwa nọbu ya n'afọ, i werekwa kọsetị kechie ya ghara ikwe ka ọ gbadachaa, ọ ga-eme na akpanwa ya nwereike ọ gaghị alaghachị azụ ebe o kwesiri, ọ ga na-ehikwa maamịrị na ahụ, o nwekwara ike inwe ""prolapse"". O kwuru na kọsetị ndị a na-arụ bụ akwara dị mmadụ n'ime afọ a kpọrọ 'Transverse Abdominus muscle' bụ ihe a na-amụta eṅomi. Maka na akwara ahụ, si n'azụ mmadụ jịkọọ afọ gị gaa n'ihu. Dkt Ojukwu kwuru na akwara ahụ ka nwaanyị ọbụla kwesiri ime ka o sie ike site na ime ụfọdụ mmegharị ahụ dị icheiche ga-enweta ya ka o wee jikọta ya ahụ mana kọsetị ga-eme ka ọ yọọ ayọ. Nwaanyị mụrụ nwa nwere ụfọdụ mmegharị ahụ o kwesịrị ime maka afọ ya kpọmkwem iji mechie oghere dị ya n'afọ nke afọ ime butere tupu o nweeike imebe ụdị ndị ọzọ. Otu onye na-achọghị ka a kpọpụta aha ya BBC Igbo gwara okwu kwuru na ya nwere ọtụtụ nsogbu n'afọ ya maka na ya na-eyi kọsetị. O kwuru na ya rie nri, afọ ya anaghị ezu ike, ọsịsọ ga na-asọ ya, eriri afọ ya ga na-atụgharị ya. Oge ya gara ụlọọgwụ, dọkịnta agwa ya kwụsị iyi ya, oge ya kwụsịrị ya ka ya malitere inweta onwe ya, nke ahụ mere ya anaghị eyizi ya. Onye ọzọ bụ Gloria Orji-Emodi kwuru na ọ bụ etu ka onye mma ka ọ ga-eme. O kwuru na kọsetị nyere ya aka oge ya mụchara nwa iji weghachite afọ ya. O kwukwara na ọ bụ dọkịnta ya gwara ya ka ọ na-eyi ya ma o nwebeghi ihe ọbụla mere ya site na ya. Onye ọzọ bụ onye na-emgharị ahụ nke ọma bụ Nneoma Ihenacho kwuru na kọsetị anaghị ata abụba afọ cha cha, kama ọ ga-eme akwara afọ ayọọ ayọ maka na oge ị na-emegharị ahụ, kama ime ka akwara ndị ahụ gbasie ike, kọseti ejide ha, ihe ị na-eme agaghị eru ha. Mana n'ihe niile a, dkt Ojukwu kwuru na ihe ndị so ya ka uru ọ na-enye ma dọọ aka na ntị ka nwaanyị jisie ike jiri imegharị ahụ hazie akwara afọ karịa iyi kọsetị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45157202,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45157202,Onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ - Dibia bekee,Otu dibia bekee bụ Ebuka Akahara ekwuola na nwoke ahụ ejidere ebe ọ gara ị tọrọ mmadụ kwesiri ị gaa ụlọọgwụ nweta nyocha zuru oke.,"Akahara kwuru na ọgwụ Tramadol na-eme ụfọdụ ihe n'ime ahụ mmadụ dịka ịtụ ụra, ịhọ agbọọ, ịta afọ mana ọ pụghị ime ka mmadụ rahụ ụra rue abali isii. N'ọnụ ya ""mmadụ ịṅụ oke Tramadol nwereike ị taa onye ahụ afọ mana ndị uweojii kwesiri ịburu nwoke ahụ gaa ụlọọgwụ"" Cheta na ndị uweojii nwụchiri otu nwoke gara ịtọ mmadụ ruru ebe ahụ rahụ ụra. Akụkọ pụtara taa kwuru na rue ugbua ọ ka nọ na-ehi ụra kpatara na ndị mmadụ na-ekwu ka ebuga ya ụlọọgwụ mee ahụ ya nyocha. Lee ihe ọ gwara BBC n'uju ebe a Ihe dibia bekee na-ekwu." afirika-50295552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50295552,Nigeria Border Closure: Ihe gọọmentị sị a ga-eme tupu ha agbapee 'border',Gọọmentị Naịjirịa n'abalị anọ nke ọnwa Nọvemba nyere ọnọdụ ihe ndị a ga-eme tupu ha agbapee okeala ha na mba ndị ọzọ bụ nke ha gbachiri kamgbe ọnwa Ọgọst.,"Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama na ndị komitii na-ahụ maka mgbachi okeala kwupụtara nke a n'Abuja. Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Ọnọdụ ndị a bụ nke mịnịsta Onyeama gụpụtara gụnyere: N'ime izuụka abụọ na-abịa abịa, gọọmentị Naịjirịa na mba ndị agbataobi ya dịka Nijee na Benin ga-enwe nzukọ ilebanye n'iwu ndị a. Ndị isi ụlọọrụ na-ahụ maka njem, mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, na ndị ọrụ nchekwa ga-eso na nzukọ a. Akụkọ ndị ga-amsị gị:" afirika-56736409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56736409,"Ipob na ESN: Etu Boko Haram, Mend, Fulani ọchiehi na otu ndị ọzọ dị n'Afrịka sị bido agha nnupuisi","Kemgbe ọnwa ole na ole gara aga, akụkọ mwakpo ndị uweojii na ogige ha na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwụ nke Naijiria.","Na mkpamkpa ndị a niile gụnyere nke Imo, Ebonyi, Abịa, Anambara na Cross River bụ na ndị a ji egbe akpa ike a kpọrọ 'unknown gunmen' na Bekee bụ ha gbuo ndị uweojii, ha buru egbe ha gbalaga. Dịka ihe ndị a na-akpọtụ, ụfọdụ ndị mmadụ malitere na-ajụ ma otu nnwereonwe Ipob na otu nchekwa ha hibere bụ 'Eastern Security Network' ha aghọọla otu agha nnupụisi? Ha rụtụrụ aka na ọtụtụ otu agha nnupụisi na-akpa mkpamkpa n'Afrịka taa, bidoro ka nwamba ma mecha ghọọ agụ owuru. Otu 'Global Terrorism Index' kọwara 'iyiegwu' bụ ihe e jiri mara otu agha nnupuisi dịka, "" Iji ike na tigbuo-zogbuo nke otu abụghị nke gọọmentị gbaa mbọ inweta ọchịchọ metụtara ndọrọdọrọ ọchịchị, akụnaụba, okpukperechi, maọbụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya site n'iyi egwu, mmanye maọbụ mmaja."" Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN' N'otu aka ahụ, ngụkọ ha bụ 'Global Terrorism Database' gosiri na Boko Haram, Fulani ọchịehi nakwa Al-Shabaab nke Somalia so n'otu ndị agha nnupuisi kachasị akpa mkpamkpa n'ụwa dum n'afọ 2020. Lee ụfọdụ otu abụghị nke gọọmentị na-egosi anya ọbara ọbara n'Afrịka, etu ha siri malite nakwa ebe ha kwụ ugbua: 1. Boko Haram Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Otu a nke onye malitere ya bụ Mohammed Yusuf bidoro n'afọ 2002 dịka otu ụka Alakụba chọrọ ịnụcha okpukpere Islam nakwa ịlụ ọgụ Jihad. Ya bụ agwọ otu onye hụrụ mechara ghọọ eke malite n'afọ 2009 dịka ndị ọrụ nchekwa Naijiria chara ha ọkụ. Etu ha si gbanwe Ha sitere n'ịgbasa oziọma Islam banye n'ihiwe otu nchekwa nke ha nke malitere ịwakpo ma bibie; ogige ndị uweojii, ọdọụgbọala, ụlọakwụkwọ, ụlọụka na imekpa ndị ekwenyeghị n'okpukpere ha ahụ. N'afọ 2010, ha wakporo ụlọmkpọrọ na Bauchi tọhapụ ndị nga karịrị 700, nke 100 n'ime ha bụ ndị otu ha. N'afọ 2014, ha tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok dị 276. Ha meechara tọrọkwa ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị Dapchi dị 109(otu narị na itoolu) n'afọ 2018. 2. Ndị Fulani ochiehi Ndị Fulani ọchịehi nke ụfọdụ kporo 'Fulani militia' na Bekee bụ ndị na-achịghari ehi si na mpaghara Ugwu rue Ndịda Naijiria na mpaghara ndị ọzọ dị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ọtụtụ n'ime ha bu ndị ụka Alakụba. Etu ha si gbanwe Mbụ a ma ha naanị dịka ndị na-achị ehi agagharị na mpaghara dị iche iche dịka ihe ha na-eji karị bụ naanị mma na osisi. Ụgbua ha ji egbe AK-47 achịgharị ehi ha, ebe ọtụtụ na-ebo ha ebubo igbusị ndị mmadụ, ibibi ugbo ndị ọrụ ubi nakwa idina ụmụnwaanyị n'ike. N'afọ 2014, nchọpụta 'Global Terrorism Index' kpọpụtara aha ndị Fulani ọchịehi dịka ""otu ndi oyiegwu no n'ogogo anọ ndị kachasi dị ọjọọ n'ụwa"". 3. Al-Shabaab Al-Shabaab bụ otu ndị oyiegwu si mba Somalia nke ebumnobi ha na mbụ bụ nchekwa obodo na ime ka mba ahụ bụrụ naani okpukperechi Alakụba(Islamic State')mana ha na-akpakwa ike na Kenya nakwa Yemen. Etu ha si gbanwe Otu mụtara Al- Shabaab n'afọ 2006 bụ otu 'Islamic Courts Union(ICU) bụ otu ndọrọndọro ọchịchị jikọrọ ụlọikpe Sharia na mba Somali,na-akpa udo na mba ahụ ka Agha Somalia bichara. Dịka,ngalaba 'Foreign Relations' nke Amerika si kọwaa, mba Ethiopia bukarị ndị ụka-Kraistị zara mbeku aka na-achi Somalia,wakporo mba ahụ Disemba 2006 chụpụ ICU na Mogadishu. Nke a meere ka ọbara banye otu ahụ n'anya. Al- Shabaab nke malitere ka onyeisi ICU tinyere akwụkwọ arụkwaghịm ma kposaa otu ahụ,bidoro igbusịsị mmadu aghara aghara. N""ọnwa Oktoba afọ 2017, ogbunigwe ha gbara gburu ihe karịri mmadụ 500 Mogadishu,isiobodo Somalia. N'afọ 2019, ha tinyere ogbunigwe nke gbagburu mmadụ 94, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ. N'otu afọ ahụ,a na-ebo ha ebubo mwakpo ụlọoriri dị na Nairobi isiobodo Kenya. 4. MEND Dịka aha ha bụ 'Movement for the Emancipation of the Niger Delta'(MEND) si dị, bụ otu na-agba mbọ ka a kwụsị mmetọ a na-emetọ gburugburu na Niger-Delta nakwa ka oke ndi mpaghara ahụ rute ha aka. Etu ha si gbanwee Otu 'MEND' si na ikute ụtaba banye ọgbọ ahịa dịka ha malitere ịtọ ndịọcha na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ mmanụ dị na Niger-Delta. A nụghị na akụkọ na ha gburu onye ọbụla ha tọọrọ mana ha na-anapụ ha ego. Ha na-agbarikwa okporo mmanụ agbịdị. Mkpamkpa ha na otu ndi yiri ha na-akpa riri Naijiria nde kwuru nde dịka ha malitere tọwa ndị nkịtị na-anapụ ha ọ kpụrụkpụ ego iji gbara isi onwe ha. E mecha,goomenti etiti nye ha' mgbaghara(amnesty) n' oge ọchịchi Musa Yar'Adua. Ipob na ESN ha a na-achọ ịghọ otu agha nnụpuisi? Ipob bụ otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra nke onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu si na otu Massob pụta hiwe. Ha ji ngagarịiwe nakwa ịgbasa ozi n'ịntanet achọ ọchịchị obi ha. Etu ha si na-agbanwe N'afọ 2020, otu Ipob hiwere otu ha kpọrọ 'Eastern Security Network' nke ha kwuru bụ maka ichekwa Ọwụwa Anyanwụ Naijiria. Mana otu onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Richard Amuwa kwuru na ""Ipob na ESN ga-aghọ otu agha nnupuisi ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe doro anya maka okwu nchekwa."" ""O kwesịrị ka e gbobido ha, e meghị otu a, ha nwere ike ịghọ ndịagha nnubupuisi n'Ọwụwa Anyanwụ. Chukwu ekwela ka ha bido kpawa agwa ka ndị Boko Haram!"" Amuwa, onye tara gọvanọ ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị ọrụ nchekwa ụta maka ebidoghị n'oge gbawa mbọ ibelata nsogbu nchekwa na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ, nke ọ sị nyere Ipob ohere ihiwe otu ESN. ""Kedụ ihe jibu ndị gọọmentị dị n'ọwụwa Anyanwụ ihibe otu nchekwa maka mpaghara ahụ? Ugbua, Ebube Agụ na ndị ESN ga-ebido nwewa nghọtahie."" Richard Amuwa bụ ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa Na nso nso a, onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Abubakar boro ebubo na ọ bụ Ipob nyụrụ ihe na-esi n'Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị bu egbe wakporo ụlọmkpọrọ nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owere tọhapụ ndị nga karịrị 1000. Kemgbe ọnwa Januwari ndị bu egbe awakpoola ogige ndị uweojii karịrị iri n'ala Igbo, magbuo dị uweojii iri. Mana otu Ipob nakwa Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwuru na o nweghị ajị dị n'abụ Ipob kama na ọ bụ ndị iro si steeti ọzọ na-anwụnyere gọọmenti steeti ahụ aja na garị. N'aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ na ọ bụrụ eziokwu na ọ bụghị Ipob hiwere ESN maka nchekwa Ọwụwa Anyanwụ, ebe ka ha nọ nsogbu nchekwa were na-akawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:" afirika-45024123,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45024123,Orji Kalu amaala afọ n'ala n'ikwụsị nyocha ya.,"Onye ọkaikpe Muhammed Idris nọ n'ụlọikpe dị n'Ikoyi, Legọs kagbuo mgbesa aka chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu maka ịkwụsi ndị EFCC inyocha ya.","Nyocha a ndị EFCC na-eme Kalu bụ maka ebubo aghụghọ ego dị ijeri naịra atọ na ọma. Dịka ọ dị ugbua, Orji Uzor Kalu so n'otu n'ime ndị isi ọchịchị pati APC bụ ndị na-achị Naịjirịa ugbua. Kalu na onye bụbu kọmishịọna ya na-ahụ maka ego bụ Jones Udeogu nakwa ụlọọrụ Slok bụ ndị ụlọọrụ EFCC na-enyocha. End of Twitter post, 1 Cheta n'ọnwa Mee afọ 2018, onye ụkaikpe na-anọchi anya Kalu bụ Awa Kalu degara ụlọikpe akwụkwọ ka akachapụ ebubo eboro ya. Nke ụlọikpe zara taa, ma kwuo ka Orji Uzor Kalu gaa n'ihu zara ọnụ ya n'aka ndị EFCC. Ihe Kalu kwuru maka PDP Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46176675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46176675,I bi na Kaduna? Ị nwere ohere ịgagharị ugbua,Akụkọ dị mkpa taa Ebuliela iwu na Kaduna,"Kaduna steeti ebuliela iwu ""onye apụla ezi"" e tinyere na steeti ahụ kemgbe ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọktoba. Mana ndị bi na Kujama, Kasuwan Magani nakwa Kachia, ka nọ n'okpuru iwu a. End of Twitter post, 1 Achụtuola onyeisi ụlọomeiwu Anambara? Akụkọ pụtara n'Anambara steeti na-ekwu na achụtuola onyeisi ụlọomeiwu ha bụ Rita Maduagwu n'oche ọchịchị. Mana Maduagwu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụghị eziokwu, na ọ ka kwụ chịm dịka onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ. Na mba ofesi, Ihe ruru mmadụ asaa gụnyere otu onye mba Izrel anwụọla n'ime ọgụ na mgba malitere n'etiti ndị agha nnupụisi mba Izrel na Palestine, n'ime obodo Gaza. Ọgu a malitere ubọchi ụka ka ndị Palestine chopụtara na ndị uweojii ndị Izrel na-eme nyocha na nzuzo n'ime Gaza. N'egwuregwu, Joe Cole gbabuuru mba Ịngland, otu Chelsea na West Ham bọọlụ, awụsala ọwa n'ihe gbasara asọmpi bọọlụ. Cole dị afo iri atọ na asaa ugbua, bidoro ịgba bọọlụ n'afọ iri na asaa ma soro Chelsea bulie iko ugboro ise. Ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe ekwuola na ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla site n'ọrịa Lasa Fiva. Ha kwukwara na ọrịa ahụ efeela mmadụ mmadụ ise si na Edo, Ebonyi nakwa Ondo steeti. Ọzọ, Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 A na-atụ anya na Hope Uzodinma bụ onye anwụchiri ma tọghapụ n'ihi ahụike ga-awuchi n'ihu kọmitị na-ahụ maka nweghachi akụnaụba ọha taa. Nke a na-abịa dịka ya na ha nwere nkwekọrịta na ọ ga-abịa zara ọnụ ya taa. Na mba ofesi Ụwa niile nọ n'iru ụjụ ugbua maka ọnwụ Stan Lee bụ otu n'ime ndị bidoro Marvel Comics nke na-eme ihe onyonyo nakwa akwụkwọ egwuregwu ụmụaka. Ọrụ ndịọzọ eji mara Stan Lee gụnyere 'Captain America', 'Thor' nakwa 'Iron Man'. N'egwuregwu Ndị otu Super Falcons nke Naịjirịa ejirila ọkpụ anọ dọọka neetị ndị otu Eleven Sisters de Gagnoa nke mba Cote d'Ivoire Ha gbagburu ha n'asọmpị enyi na enyi ha nwere na mgbede Monde na Abidjan. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: 'Onye anọghị ebe e so kee ihe, oke ya efuo' - Victor Umeh Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-49324617,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49324617,DJ Arafat dead: Ndị otiegwu akwaala arịrị n'ihi ọnwụ ya,Ndị otiegwu dị icheiche na Naịjirịa nakwa mba Afrịka ndị ọzọ ebeela akwa arịrị n'ihi ọnwụ onye otu ha a ma dịka DJ Arafat.,"DJ Arafat ndị Naịjirịa ga-echeta n'ihi egwu ya na J.Martins kụrụ nke a kpọrọ ""Touching Body"", nwụrụ n'ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst, 2019 na mmerụ ahụ o nwere n'ihe mbere okporoụzọ. Akụkọ kwuru na ọ na-agba ọgbatumtum ya mgbe ya na ụgbọala sukọtara isi. Ọnwụ nwaamadị a wutere ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị otiegwu ibe ya n'Afrịka gụnyere Davido na ndị ọzọ. End of Twitter post, 1 J.Martins bụ onye ya na ya kụkọrọ egwu, tinyere okwu nke ya Onye bụ DJ Arafat? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51372241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51372241,China Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka ọrịa a - Onye Naịjirịa nọ na China,"Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha nọ ebe ahụ si kwụrụ.","Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha. Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ. ""Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ 'Quarantine' ugbua. ""A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ ga bute nje ahụ."" Gee ihe o kwuru n'uju." afirika-57296028,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57296028,Biafra Remembrance: Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi,"Mbazulike Amechi bụ otu onye n'ime ndị so zọo nnwereonwe Naịjirịa n'afọ 1960, etinyela ọnụ n'ihe gbasara agha Biafra.","Mbazulike kwuru na ọ bụ naanị otu onye ka a na-anụ n'Ipob ugbua, mana ọ dị iche n'oge nke ha bụ mgbe ọ bụ ọtụtụ olu ka a na-anụ. Mbazulike kwuru na ndị nke ugbua anaghị ege ndụmọdụ, mana ọ bụrụ na ndị Igbo nọ na mba kwuo ka e nye ndị Igbo 'Plebiscite' (ịtụ vootu ma a ga-apụ maọbụ agaghị apụ), na a ga-ama ma ụfọdụ a ga-atụ maọbụ agaghị atụ." afirika-55673887,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55673887,School Resumption Day: Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka ụlọakwụkwọ ga-eme ọzọ na 18 Jenuwarị,"Na-agbanyeghị na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje coronavirus na Naịjirịa na-agbali elu, gọọmentị etiti ekwechirila na ụlọakwụkwọ ga-emeperịrịrị n'ụbọchị Mọnde na-abịa abịa.",Ọtụtụ na-ekwu na mkpebi a ekwesịghị ekwesị n'ihi na onweghị ihe etinyere iji gbochie mfesa ọrịa a. Mana ụfọdụ na-ekwukwa na o kwesịrị ekwesị ka e mepee akwụkwọ n'ihi na o teela ụmụakwụkwọ nọ n'ụlọ. BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị nne na nna ajụjụ ọnụ iji mata ihe ha chere. Lee ya n'ihe onyonyoo dị n'elu. Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara. afirika-47779202,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47779202,Rochas Okorocha kachiri ntị - Victor Umeh,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na oge na-abịa mgbe ndị Imo ga-ajụ Rochas ajụjụ maka akụnaụba steeti ahụ.",O kwukwara na ọ dọrọ ya bụ Rochas aka na ntị maka isonye n'APC mana Rochas siri ọnwụ gaa n'ihu. Cheta na otu APC kwụsịrị Rochas ọrụ n'ike n'otu ha ebe Inec jụrụ ịnye ya asambodo mmeri ya. Dịka ọ dị ugbua anyị na-agbalị ịnụ olu Rochas gbasara ebubo a mana ọ zabeghi. Gee ihe Victor Umeh kwuru n'uju: afirika-54341158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54341158,"Ihe anyị ma maka ọnwụ George Smith, onye si Malaysia lọta e gburu n'Aba","""E kpesarala ndị uweojii, anyị na-esikwanụ imi n'ala ịnwụchi ndị mere ihe a, ka ha bịa zaa ajụjụ dịka iwu si chọọ"", ka Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti kwuru maka ogbugbu George Smith.","Ogbonna kwuru nke a iji saa ajụjụ a jụrụ ya maka mgbagbu a gbagburu Smith bụ nwaamadi ka si mba Maleshia lọta ndị omekome gbagburu ebe ọ gara ịkpụ isi na mpaghara Ohanku dị n'Aba, Abịa steeti n'ụbọchị 27 nke ọnwa a. Ogbonna kwuru na ha na-agbasi mbọ ike dịka ndị uweojii ịhụ na ha chọtara ndị kpara arụ a, ma kwuo na ọ bụ n'ihi igbochi ụdịrị ihe a ka ha jiri na-agwa ndị mmadụ ka ha nyere ha aka site n'ịgbara ha ama ndị bụ ndị ọjọọ n'agbataobi ha. BBC gara n'ihu jụọ ndị agbataobi ahụ site n'ọnụ onye ntaakụkọ kwuru na ndị ogbe ahụ na-ahụta ya ka mmegwara nke ndị otu nzuzo. Ha gwara onye ntaakụkọ ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya na ọ ga-abụ na ndị otu nzuzo chọtara Smith nke ụfọdụ foto o sere na mbụ gosiri na ọ bụ onye otu nzuzo. Ha kwuru na nke a abụghị mbụ a na-egbu mmadụ etu a n'agbataobi ahụ, na e gbukwara otu nwaokorobịa n'izu gara aga. Smith ka mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Septemba a dịka ihe o tinyere na Facebook gosiri." afirika-48810294,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48810294,Igbo Music: Etu ọja si agwa mmadụ na mmụọ okwu,Ihe a bụ ajụjụ Gerald Eze jụrụ ka obidoro ịkọwa usoro ọja.,"Ọja bụkwanụ ihe egwu di Igbo kemgbe gbuo. O so na ngwa egwu omenala nabatara ọfụma. Dịka onye na-akuzi egwu na mahadụm, Gerald Eze mụrụ ọja ruo n'isi ya, mana ọ sị na ọbụghị sọsọ nke agụtara n'akwụkwọ ka ya ma, makana ndị okenye gbunyere ya asọ n'ọnụ. Lee okwu na emume o ji bịa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45186256,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45186256,"Onye nta akụkọ ""Premium times"" ka nọ na nga","Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na Naịjiria bụ Jimoh Moshood ekwuola na ya amaghị ka esi nwụchie onye ntaakụkọ ''Premium Times.""dika ụlọọrụ mgbasa ozi 'Daily Post'' siri depụta.","Ogundipe bụ onye ntaakụkọ na-ede maka nchekwa Obodo Ndị Premium Times bụ ụlọọrụ ebe Ogundipe na-arụ depụtara na a nwụchịrị Ogundipe maka ebubo e boro ya na o na-ede akụkọ na-ezighị ezi gbasara ndị uweojii Naịjirịa. Mana ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ayọ ka a tọghapụ Samuel Ogundipe makana ọchịchị a nọ na ya ụgbụa bụ ọchịchị onye kwuo uche ya. N'ọnụ ya, ""A machaghị m maka nwụchị a mana otu ihe m mara bụ na ndị uweojii nwere ike sị onye ọ bụla bụ onye Naịjirịa bia ka enyocha ya."" @realFFK na-ayọ osote onyeisiala Naịjirịa na-anọchite anya onyeisala ụgbua ka ọ nye iwu ka a tọghapụ Ogundipe. @GovAyoFayose kwuru ka ụmụ Naịjirịa kaatọ etu esi nwụchị Ogundipe ma na-ayọkwa ka a tọghapụ ya. @AmnestyNigeria na-eti iwu ka akpọpụta Ogundipe makana ọrụ mgbasa ozi abụghị mpụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44736373,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44736373,Biafra: Okey Ndibe kọrọ ihe ọ hụrụ dịka nwata nọ mgbe a lụrụ agha Biafra,"Okey Ndibe sị na, ""Agha abụghị ihe onye ọbụla hụrụ ihe mere n'afọ 1967 ruo 1970 ga-asị ka o mee ọzọ.""",O kwukwara ihe mere ogbaghara jiri ka dị n'ala Naịjirịa ruo taa. O nyere ndị ntorobịa ọdụmọdụ gbasara otu ha siri chọọ ka ha nwe nwereonwe nke ha - nsogbu ga-adị na ya na ihe ha kwesiri ime. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Grace Ekpu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-47266119,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47266119,Nigeria Election 2019: Ihe anọ onyeisi Inec kwuru maka nhigharị ntuliaka,"Yakubu Mahmood bụ onyeisi ụlọọrụ Inec, kwuru na ọ bụ ihe ọdachi ndị mere n'ụlọọrụ ha dị iche iche butere nhigharị ntuliaka.","E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015 Na nzukọ ya na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere, o kwuru na ọ bụghị enweghi nchekwa zuru oke butere ya bụ nhigharị. O kwukwara na ndị otu pati amaghịkwa maka ya, kama na ọ bụ ọkụ ndị gbara ụlọọrụ ha, enwetezughi ụgbọala ga-eburu ngwaọrụ ha ebe dị iche iche na ihe ndị ọzọ, kpatara ya. Mahmood rịọrọ mgbaghara maka ihigharị ụbọchị ntuliaka site na Febrụwarị 16 ruo Febrụwarị 23. Ihe ndị ọzọ o kwuru Inec Anambra: Ndị Anambara atụla uche maka na Inec kwụ gidigbam" afirika-43139194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43139194,Ndị na-emepụta ngwa ahịa n'Anambra sị ka arụọ ọdọ ehi n'ala Igbo,Onye isi ngalaba a na-akpọ 'Association of Small and Medium Scale Industries' na-asụsụ bekee nke dị na Anambra steetị bụ Justin Okolo na-rịọ ndị gọvanọ dị icheiche n'ala Igbo ka ha tinye ego na-ịmalịte ọdọ ehị (nke akpọrọ Cattle Colony n'asụsụ Bekee) dị icheiche n'ala Igbo.,"Ha na-ebo ndị na-achị ehi ogbugbu ọtụtụ mmadụ n'ala Igbo Ha kwuru na onwere ike ị kwụsị nsogbu dị n'etịtị ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi n'ala Igbo ma bụtekwa ọrụ dị icheiche na-ebe ahụ. Mazị Okolo kwuru na ya kwetara n'echiche onye isi ndị Ohanaeze ndi igbo bụ Nnia Nwodo banyere ịmalite ebe a na-azụ ehị. Nwodo, n'ụbọchị ole na ole garaga, rịọ ndị ọrụ ugbo nwere ebe a na-azụ ehị tụpụ a lụọ agha Biafra ka ha laghachị na yabụ ọrụ makana udị ọrụ nwere nnukwu uru. Nwodo ka na-arịọ ndị gọvanọ steeti ahụ ka ha nye aka maka ọtụtụ ụmụ afọ anaghị enwe ọrụ. Okolo gwara ndị nta akụkọ na echiche ya bụ na oge eruola mgbe ndị Igbo ga amalite ọrụ di icheiche ga eweta ego na akụnụba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55576444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55576444,Ohaneze Ndigbo: Mma na nke atọchaghị Igbo ọchị Ohaneze mere n' oge ọchịchị Nnia Nwodo,N'abalị iri nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ka Nnia Nwodo pịakọrọ oche ya dịka onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.,"Ọchịchị ya nke malitere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2017 bịara na njedebe dịka ntụlịaka otu ahụ e mere n'Owere ụbọchị ụka (10/1/2021) họpụtara George Obiozor dịka onye ga-eweghara oche onyeisi Ohaneze. Dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ele anya n'enyo ịkọta etu ọchịchị Obiozor ga-adị, BBC Igbo tinyere anya na mmiri lee ihe Ohaneze mere n' oge Nwodo: 1. Ọnụ na-ekwuru ọha na eze ndị Igbo Ndị isi otu Ohaneze oge Nnia Nwodo bụ onyeisi Oge otu Ohaneze Ndigbo malitere n' afọ 1976, ihe a kpọrọ otu a bụ ""Igbo National Assembly"". Ọ bụ ọkaiwu a ma ama bụ Ben Nwabueze bụ onye kpokobara Ndigbo nwere agba iji bido otu a. Ebumnobi otu ahụ nke ha malitere oge Agha Biafra kwụsịrị bụ ịgba mbọ maka ọdịmma Igbo, dika otu Afenifere na Arewa Consultative Forum na-achọ ndị agbụrụ nke ha. Gọọmentị etiti machiri otu ahụ, ha malite ọzọ ma gụgharia ya, ""Ohaneze Ndigbo"". Mana ebumnobi ha dịka ọ dị na mbụ ka bụkwa ikwuru Ndigbo. Ọrụ a ka ndị niile chịgoro otu Ohaneze, malite na Ben Nwabueze bụ onyeisi mbụ ya ruo na Gary Igariwey bụ onye nyefere Nnia Nwodo ọchịchị, gbara mbọ ịrụ. Mana ndị ma ihe ekwe na- akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị obodo dịka Steve Nwosu, onye ntaakụkọ a na-anụ aha ya na-ekwu na, o nweghị onye chịgoro otu Ohaneze na nso nso a ji nhazi okwu na akọ bulie okwu ọdịmma Igbo ka Nnia Nwodo. Ha kwuru n' ọchịchị ya wetara Igbo ùgwù. Nwosu sị, ""Oge ọchịchị ya dịịrị ndị Igbo mma."" ""Onyeisi Ohaneze pụrụ apụ bụ Nnia Nwodo buliri Ohaneze."" 'Ihe o jiri dị mkpa na Ndigbo niile ga-apụta tuo vootu' ""O ji nka ịhazi okwu nakwa akọ na uche gba mbọ maka ikike dịrị ndị Igbo"". Ijị maa atụ: Oge onyeisi Arewa Consultative bụ Ango Abdullah bọrọ ndi Igbo ebubo na ọ bụ ha na-ebute ọgbaghara ebe niile e nwere nsogbu, ọkachasị na Ọdịda Anyanwụ, Ọhaneze nyere ha ọsịsa ma kwuo na Ndigbo bụ ndị na-akpa udo ma na akwalite mmepe obodo ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha. Ọzọ bụ na otu Ohaneze Ndigbo katọrọ ogbugbu e gburu onye otu Ipob n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa n'Emene,Enugwu steeti. 2. Igbagha atụmatụ ọbụla ha hụtara ka nke megidere ndị Igbo Nwodo sonyeere mmadụ iri na ise bụ otu si Ndida Anyanwụ na etiti Ugwu were gbaa onyeisiala Nigeria bụ Muhammadụ Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja maka mmegbu ndị si na mpaghara ndị a na ịnye ọkwa n'ọrụ nchekwa nakwa ngalaba gọọmenti gbara ọkpụrụkpụ. Ọzọ dịka ibe ya bụ oge gọọmentị etiti machiri otu na- achọ nnwereonwe Biafra, bụ Ipob n'ịchafụ dika otu na-eyi ndụ egwu, Ohaneze tiri mkpu ka gọọmenti tọhapụ otu ahụ na-agbanyeghị n'otu Ipob na-enye Ohaneze nnukwu isi ọwụwa. Ohaneze tikwara mkpu maka ngọnahụ nke ha boro ebubo na gọọmenti etiti gọnahụrụ ndị Igbo na mbulielu e buliri ndị uweojii welitere isi n'ọrụ na nso nso a. Ihe Ohaneze jiri kwụnyere Atiku - Nnia Nwodo 3.Itinye aka n'ofe mmiri Niger Igbo sị na e zuo ka a ha eri udele a tọtuo ngịga. A nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbọọ ụfụfụ. Ihe ọzọ pụrụ iche otu Ohaneze mere oge ọchịchị Nnịa Nwodo bụ isetịpụ aka kwe ndị agbụrụ ndị ọzọ nọ n'ofe mmiri ndị ha na Igbo nwere otu obi n'ihe gbasara ka ihe si aga na Naijiria aka udo nke ha kpọrọ ""Handshake Across the Niger"" na Bekee. Ndị a mechara tikọọ isi ọnụ ma kpọọ oku ka a hazigharịa Naijiria na mpaghara, na mpaghara ( restructuring). Ọ bụ site na mmekọrịta, ka Nnia Nwodo bụ onye ọchịchị bịara n'isi njedebe n'Ohaneze Ndigbo, kpalitere mmalite otu 'Southern and Middle Belts Forum' bụ otu họrọ ya na nsonso a dịka onye nchịkọta ha. Otu a gụnyere otu dị icheiche na -anọchite agbụrụ di iche iche na Ndịda Anyanwụ Naijiria dịka Afenifere (Yourba), PANDEF (Niger Delta), Ohanaeze Ndigbo na 'Middle Belt Forum'. 4. Ịkpalite ndị Gọvanọ Ọwụwa- Anyanwu ịmalite kwa ọgbakọ ha ọzọ Nnia Nwodo so na ndị nyere aka ịkwalitekwa ọgbakọ ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-agbabu ọnyụpa dịka onye ndụmọdụ mgbasaozi Nwodo bụ Attamah si gwa BBC, mana ọ bụ Nnia Nwodo kpalitere otu ahu ọzọ. Nke a mere na ọgbakọ ha na-agụnyekwa ndị otu Ohaneze iji mụta echiche Ohaneze n'okwu a kpụ n'ọnụ. O nwere ebe Nwodo dajọrọ? Otu Ohaneze kwadoro Atiku oge ọ zọrọ ọkwa onyeisiala na 2019, maba ọtụtụ kwuru na nke a ekwesịghị ekwesị. Ọ bụghị naanị ihe ọma, ihe ọma ka a na-agụkọ, ụfọdụ ndị Igbo na-ebo Nnia Nwodo ebubo ime ndị Igbo ""a sụọ ala ma a kọghị ji"". Lee ụfọdụ ebe ha kwuru n'ọchịchị ya riri mperi: Inye Atiku Nkwado Ebubo nke a bụ maka na otu Ohaneze kwụnyeere Atiku Abubakar oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati PDP n' afọ 2019. Dịka Uche Okwukwu bụbu odeakwụkwọ ukwu Ohaneze siri kwuo, otu Ohaneze ekwesighị inwe pati ha sonyeere ukwu iche. Mana Onye ndụmọdụ mgbasaozi Nwodo bụ Emeka Attamah kwụrụ na ""ọ bụ ndị Igbo kwuru, ọ bụghị Nnịa Nwodo.""Ọ bụ oke Ndigbo iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo Attamah kọwara na ọ bụ n'ọgbakọ ndị Igbo na otu gbụrụ ndị ọzọ, gụnyere Pandef na Afenifere, nke e mere n'abalị 28 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2018, ka a nọrọ kwupụta mkpebi ịkwụnyere Atiku. Ọ gara n' ihu kwuo n' otu Igbo sị tụọ vootu na ntuliaka 2019 goziri n'ezie na ọ bụghị Ọhaneze. Nkewa otu Ohaneze Ndị Eze Igbo E nwere nghọtahie n' Ohaneze malite oge e mechara ntuliaka tụpụtara ya n' afọ 2017. Nghọtahie in ime Ohaneze kawanyere njọ dịka otú otu pụtara gbálìa idenye aha yiri nke Ohaneze n'aka ngalaba na-ahụ maka ndebanye aha a kpọrọ CAC ma ya nụ mbọ kụrụ afọ n'ala.E nwekwara nsogbu dịka ngalaba ntorobịa Ohanézè na ndị okenye ha ebighị otu olu ekwu okwu dịka ọ siri metụta ndị Igbo. Ọzọ nụ nghọtahie nke butere nchụpụ Uche Okwukwu dịka Odeakwụkwọ Ohanézè, esemokwu ahụ ebighị rue ọgwụgwụ ọchịchị nke na Okwukwu gbálìrì ịkponye aja na garị dịka Ohanézè na-akwado ntuliaka ha mere na nso nso a.Ụfọdụ hụtara ọgbaghara niile ndị a dịka nkata ndị achọghị ọdịmma na ịdịkọnotu Ndígbo na-akpa, ebe ụfọdụ boro ya akpaghị ụka akpa nke ọchịchị Nwodo. Onyeisi otu 'Alaigbo Development Foundation' bụ Okammụta Uzoma Nwali boro Nnịa Nwodo ebubo Ịkewa otu ahụ. Ọ sị, ""N' oge ọchịchị ya, Ọhaneze Ndígbo kewara n'otu, n'otu. Ndị ha na John Nnia Nwodo na-akpa n' ọdụdụ ọha eze bụ ndị oji akpa eli ozu n' Alaigbo.""Mana onye ndụmọdụ Nwodo bụ Emeka Attamah gwara BBC Igbo na ebubo na Nwodo kewara Ohanézè bụ okpotokpo asị.""Nwodo kwudoro ma hapụkwa Ohanézè n' otu. Enwe ihe o meere ọ bụ inye otu ahụ agba."" Ọ gara n' ihu kwuo na ndị na- akpọ onwe ha otu si n' Ohaneze pụta bụ ndị dajọrọ dịka Ikechukwu Isiguzoro ""bụ onye e wepụrụ maka akwụbaghị aka ọtọ nakwa ịda iwu Ohanézè Ndígbo dika onye ndu ngalaba nke ndị ntorobịa na Uche Okwukwu bụ onye bụbụ odeakwụkwọ mana n'ihi nnupuisi, ndị Imeobi Ohaneze kwụsịtụrụ ya ọrụ, mana ọ na- agagharị na- akpọ onwe ya Odeakwụkwọ.""" afirika-52839618,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52839618,Menstrual hygiene: Ihe nwoke na nwaanyị kwesiri ịma maka nsọ ụmụnwaanyị,"Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke, ndị na nna na ndị ọrụahụike nwere mkparịta ụka maka nsọ ụmụnwaanyị maka emume ncheta ụbọchị nsọ nwaanyi dịka United Nations si hibe.","N'oge ugbua, nsọ ụmụnwaanyị anaghị egbochi ha ime ihe ọbụla, mana ọ dịghị otu a n'oge gboo Dọkịta Chukwudi Ufondu, Florence Igboayaka, Adaora Okoro, Maazị Chidi na Oriakụ Onyinye Obimdike na Munachi Okereke nọ na ya bụ mkparịtaụka taa. Ihe ndị bụ ọkpụrụkpụ okwu sọ n'ihe ha kwuru. Gaazịa na ya bụ ihe onyonyo maka ihe ndị ọzọ: Akụkọ ga-amasị gị:" 52559788,https://www.bbc.com/igbo/52559788,Ị nyara bọres ka ị kpọrọ ọga? Lee egwuregwu ụmụaka mgbe elu bụ ala ọsa,"N'oge gboo, ndị nne na-eji olu ike akpọtụrụ ụmụaka ha kpapụrụ akpapụ gaa igwu egwuregwu n'agbataobi ha maọbụ n'ama egwuregwu.","Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo. Ọ na-abụ nwantakịrị nụ olu nne ya, o jiri ọsọ jiri ije laruo ụlọ maka ụtarị. Oge ahụ ka ụmụaka mara etu e si enwe aṅụrị na etu e si egwu egwuregwu. Oge ahụ, ndị mmadụ anaghị achịrị obi ha n'aka maka onye agbataobi ha, kama nwa bụ nwa ọha, nwantakịrị ọbụla nwereike ịga n'ụlọ onye agbataobi ya ọbụla soro ụmụaka ibe ya gwurutu egwu. Egwuregwu akarịka nụ, tupe e mee nke a, mee nke ọzọ, chi a na-achọ iji, ụfọdụ oge, ụmụaka anaghị echeta dị na ha eribeghi nri. Ọ dịzị ka ụfọdụ egwuregwu ahụ alachala maka na o nweghizi onye nwere ohere ha ugbua, nakwa egwu abịala ọtụtụ mmadụ, e nweghizi ntụkwasi obi ebe agbataobi nọ. Mana, ọ dị mma ka anyị laghachitu azụ chetara ihe ndụ dịka ya oge oge gboo. Egwuregwu ụmụaka n'egwu mgbe gboo 1. Ịwụ ụdọ: Ụmụaka na-awụ ụdọ ihe dị egwu. A na-eji ya eme nwale ọ ga-emeri ibe ya ọkachasị ụmụnwaanyị. Otu onye jide n'otu isi, onye ọzọ ejide n'isi nke ọzọ, ndị mmadụ e si n'ihu mana azụ na-abanye. Ọ naghị adị mfe isi n'azụ banye mana ebe ahụ ka ọ na-aka mma maka ụfọdụ oge, iwu na-abụ na ị ga-esiriri n'azụ febanye, ị melighi ya, ị pụọ. Ịwụ ụdọ bụkwazi otu ụzọ ndị mmadụ si emegharị ahụ iji taa ahụ ma gbasie ike ugbua 2. Ịkpọ ọga: Ụmụnwaanyị kwenu! Ebe a ka ụmụaka ụmụnwaanyị na-egosi onwe ha nke ọma. Ụfọdụ ụmụnwaanyị ga-akpọgide ọga kpọgide ọga, ha agaghịdị anụ oge nne ha kpọrọ ha ruo mgbe o jiri ụtarị bịa. Ịkpọ ọga ọkụ ọkụ bụ nụ egwu e ji, i juo oyii, a gafee gị ozugbo. A na-akpọ ọga, a na-akpụ aka n'akwa ha, oge ụfọdụ na-egosi ụdị ịba ha yi ma ndị na-eyighi ịba cha cha. Ụfọọ̄ụ ụmụnwoke kpọkwara ọga n'onwe ha mana ọ bụ ọkacha ụmụnwaanyị bụ ndị kpọrọ ọga nke ọma. 3. Ife Kaịt(Kite): ""I fere kaị mgbe i pere mpe?"" N'ọlụ onye egwu Zoro. Ife kaịt adịghị mfe cha cha maka ọtụtụ ndị amụtaghị ya rue taa. Ị ga-eji aka gị rụọ ya ma zuru eriri akwa nne gị jiri fee kaịa mana ekwela ka o jide gị. Ife kaịt tara obere akpụ mana ndị mụtara ya na-efepụ ya, ụdị ọṅụ na mkpu a na-eti ma ị na-afụ ya n'igwe. Mmadụ niile a na-agwa gị etu ị ga-esi mee ya ka ghara ịda mana ihe ọbụla gbagoro elu ga-agbadatarịrị ala. Ụdị obi aṅụrị e ji efe kaịt dị egwu 4. Ịtụ swelụ: Ọ bụ nke otu ụkwụ, ka ọ bụ nke ụkwụ abụọ na-akacha gị mma ịtụ? Ọ bụ nke a na-aka anọ kaọbụ ise kaọbụ isii. Swelụ bụ o zuru Igbo ọnụ, onye elu na onye ala, nwoke na nwaanyị tụrụ swelu. Ọ nyere aka ịzụ ụmụaka mee ka ha sie ike ma n'ụkwụ ma n'ume maka na ọ dịghị mfe iji otu ụkwụ gazuo swelu laghachite azụ. O nwekwara ndị a na-akpa akpa, ọ ga-abụ ị tụọ okwe gị, i jiri ụkwụ na-akpa ya ruo mgbe o ruru ebe ọ ga ejedebe. 5. 'Oliọma Danger': Ma rue ugbua, ebe ọbụla i kwuru olioma 'danger' ọtụtụ mmadụ ga-aza gị soro gị gụwa egwu ahụ etu e si agụ ya. I chetakwara etu e si eme ya, a na-agụ egwu ahụ, a na-atụli mmadụ elu mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ n'azụ a na-awọta onye ahụ jide ya n'aka ka ọ ghara ịda n'ala. A na-eme nke a, a na-agụ: ""Oliọma danger, oliọma le, Olioma chus baby chus baby lee my mother le ole nkenkere sike uuh! Ewu na ọkụkọ sike, onye ọcha na-ese foto, onye Igbo na-eme ngala..."" Ngwa gụchazie ya. 6. Tinkọm tịnkọm: ""Tịnkọm tịnkọm, tịnkọm tịnkọm, tịkalika alịka, dalin nke m o, dalin nke m ooo"" I nwereike imezuo nke a. 7. Ịnya bọres Ebe a ka a na-ama ụmụnwoke nwere akọnauche gbasara ịrụ igwe. Bọres bụ ihe ụmụnwoke ji osisi arụ tinye ya ụkpụrụ ọ ji abụ a kwa ya, ọ gbapụ ọsọ. 8. Kpukpukpu ogene: ""Kpukpukpu ogene, ooo gene o genene, onye na-achọ ogene..."" Egwu a bụ egwu e ji achọ mmadụ maọbụ ụmụaka kwụrụcha ọtọ cherita onwe ihu na-akụkọrịta aka, otu onye a na-aga n'okpuru ha. Ha na-agụ egwu ahụ na-apakọrịta aka. 9. Ịgba bọọlụ jiri osisi mee ọnụ goolu: Ụmụnwoke mere nke a nke ọma maka na ọ bụ ha na-agbakarị bọọlụ mana ụmụnwaanyị mekwara ya. Ịgba bọọlụ na-amasịkwa ụfọdụ ụmụnwaanyị n'ezie. 10. Ịwọ akwa na ịzụ okwe Ụmụnwaanyị na-awọkarị akwa ebe ụmụnwoke na-azụ oke. E nwere ihe a na-akpọ mkpụrụ a na-ahọkọta e ji awọ ya, a wụsaa mkpụrụ akwa ahụ asatọ n'ala e jiri otu na-atụli elu ma ghọta ya. Ị tulie otu, oge ọ nọ n'elu, ị tụtụta otu ọzọ, ọ dị abụọ, ị wụsa ya n'akụkụ, i mechaa otu otu, ị malite chịrịwa ya abụọ abụọ na atọ atọ rue mgbe ị ga-achịrịcha ha niile n'otu oge. E nwereike iji mkpụrụ okwute wọọ akwa ma ị hụghị mkpụrụ akwa N'aka nke ọzọ, ịzụ okwe bụ nke a ka na-eme ruo taa. Ọtụtụ ezinaụlọ nwere okwe ahụ n'ụlọ ha iji cheta oge gboo nakwa iji zuo ike. Okwe bụkwa ihe ụmụaka nakwa ndị okenye maka na ụbụrụ ka e ji eme ya. Ndị enweghi okwe na-ese ya n'ala were mkpụrụ okwe iri abụọ na anọ e ji azụ ya. Egwuregwu ndị na ndị ọzọ anyị edepụtaghị bụ ihe ụmụaka Igbo ji enwe aṅụrị oge gboo. Mana ugbua, teknụzụ abịala gbanwee etu ụmụaka si enweta onwe ha. Ihe ụmụaka jizi egwu egwu taa. 1. Ihe onyonyo: Ụmụaka na-atọzi n'ihu onyonyo ekiri onyonyo dị icheiche 2. Egwuregwu onyonyo(video games): Nke a bụkwa nke na-ewu. O nweghi ụdịrị egwuregwu na-adịghịzi n'ụdị a dịka egwuregu bọọlụ na ndị ọzọ 3. Ihe ndị e ji egwuegwu(Toys): E nwekwaziri ihe ndị n'ụdị dị icheiche na-eme ụmụaka obi aṅụrị. Eziokwu bụ na etu e siri mee ya n'oge gboo dị mma, etu e si emekwa taa amaka. Ọ dịkwa mma ma ọ bụrụ na nne na nna ga-akụziri ụmụ ha nke gboo tinyere nke ọgbara ọhụrụ taa n'ihi na nke ndị gboo na-eme ka ụmụaka nwee ezi mmekọrịta n'etiti onwe ha iji mara etu ha si eme omume na ihe na-adị nwanne ha mma karịa ịkpa icheiche. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46863883,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46863883,Kay Obum: Onye nwere apa gbalịa nabata ya,"Kay Obum bụ onye nwere apa si n'oge ọkụ gbara ya ka ọ bụ nwata dị afọ itoolu, kwuru na ịnabata apa gị ka mma.","O gwara BBC Igbo etu o si chee echiche ịkpụchapụ anụ ahụ ya ka ọ na-amụke nke Bekee kpọrọ ""plastic surgery"", mana dọkịnta ya gwara ya chefuo maka ya. O kwuru na makana ọ nabatara apa ya, ọ na-enyere ndị ọzọ aka ịnabata ya. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-53017009,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53017009,"Democracy day: 'Buhari jide aka a o ji rụọ na ngwụcha, ọchịchị ya ga-abụ ihe lara n'iyi'",Taa bụ ụbọchị a na-ana eme ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.,BBC Igbo bara n'ime obodo ịchọpụta ihe bụ uche ndị mmadụ gbasara ọchịchị onyeisiala Muhammadụ Buhari n'afọ ise ọ chigoro. Lee ihe ha gwara anyị n'ihe onyonyo a: Ọrụ a si n'aka: Ebere Ekeokpara Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-51378911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51378911,"World Cancer Day 2020: ""Etu m si chọpụta na m nwere Cancer"" - Anwuli Ojogwu",Chi jiri n'ehihie n'anya Anwuli Ojogwu bụ nwaagboghọ chọpụtara na ya nwere akpụ kansa n'afọ 2018.,"Chi ya gbaara ya ama n'oge maka ọrịa ahụ malitere ito ya n'ara n'afọ ahụ. Nke a mere mgbe Anwuli kụrụ obi ya n'ọnụụzọ ka o si n'ụlọekwu ya na-apụta. Nke ahụ mere ka ọbara sị ya n'ara na-agbapụta. Nke ahụ bụ ụzọ pụrụiche chi ya ji gbaara ya ama n'oge. Nke a mere ka ọ malite ịjụ ese ka ya bụ mmiri si baa opi ụgbọghọrọ. Lezie ihe nkiri a ka ịhụ ka o si mee. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chiemela Peters Mgbahuru" afirika-55625568,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55625568,Ned Nwoko: Asịrị e jiri m gbaa na 'social media' ka wutekarịcha m,"Dịka ọtụtụ mmadụ na-ekwusi ike etu uche ha dị maka atụmatụ iwu a kpọrọ ""social media bill"" na Bekee, Sinetọ Ned Nwoke gwara BBC Igbo na ya nabatara ya.","Ọ sị na ihe mere ya jiri nabata ya bụ ihe mere ya n' soshal midia, ebe o tu nwata nwoke ọ maghị boro ya ebubo ịbụ nna ya. O kwuru na nwata ahụ boro ya na-aya tụwara nnne ya ime, gbalaga. Ọ sị na etu ndi mmadụ jiri na-emetọ aha mmadụ nakwa na-ebo ebubo aghara aghara mere o jiri kwesi na e nwere ihe eji etinye anya na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50045980,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045980,Border Closure: 'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali,"Ngalaba gọọmentị a kpọrọ ""Ex-Swift Response"" nke mejuputara ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke ala bụ (Nigeria Customs Service) na ndị na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ (Nigeria Immigration Service, ekwuola na ha agaghị agbape oke Naijirịa tupu ndị mba ha na Naijirịa gbara oke emee ka ha sị kwekọrịta.","Onyeisi ngalaba nchekwa oke ala, Hameed Ali Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke (Customs) bụ Hameed Ali kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zutere. Ali kwuru na naanị ihe ha chọrọ bụ ka mba ndị a bido ime ihe ha na Naijirịa kwekọrịtara maka ngafe ibu mgbe Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala. O kwuru na mgbachi oke ala Naijirịa eritela erere ihe ruru otu ijeri naira na ọma anọ (1.4 billion) sitere na mmachi osikapa na ahịa iwu ndị ọzọ. Hameed Ali kọwakwara na mba Nijee ebidola ime ka ha siri kwekorịta site n'ịmachi ibubata osikapa na Naijirịa. Ndị nchekwa ogige nke 'Ex-Swift Response' N'aka nke ọzọ, onyeisi ngalaba na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ bụ Muhammed Babandede kwukwara na ha anwụchiela ụfọdụ ndị mmadụ n'oke ala Naijirịa. O kwukwara na onye na-enweghị akwụkwọ njem agaghị agafe oke Naijirịa. Babandede kwuru na ha gbochiri ndị Naijirịa otu nari na iri ise (150) ịhapụ Naijiria makana akwụkwọ ha ezighị ezi, gbochie ndị mmadụ otu puku na otu narị na iri na ọtụ (1,111) ịbata maka akwụkwọ ezighi ezi. O kwukwara na ha ejidela ma chụghachị mmadụ narị asaa na iri abụo na asatọ (728) makana ha enweghi akwụkwọ ziri ezi ma nọrọ na Naijiria. Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwụchikwara ndị Pakistan na Nọt Koriya na-esighi n'oke ECOWAS, chụghachị ha ma machie ha ịbata Naijiria ebighebi. Akụko ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12" 45293501,https://www.bbc.com/igbo/45293501,Afịaọlụ Nnewi atala isi otu nwoke,"Otu onye bi na Nnewi gwara BBC na mmanwụ ji karama sugbuo otu nwoke n' Orie Agbo dị na Nnewichi, Nnewi, Anambara steeti n'ụbọchị Toosde.","Dịka nwoke ahụ achọghị ka akpọ aha ya siri kọwa, ọ bụ ọgụ onye-ka-ike dapụtara na-etiti otu mmanwụ abụọ butere ka a sugbuo otu nwoke a mabeghị aha ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Anambara steeti bụ Harụna Mohammed azaghị ekwentị ya mgbe BBC kpọrọ ya. Ka ọ dị ugbu a otu ọgbakọ Nnewi a kpọrọ 'Nzukọra Nnewi n'ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Ike Edoji wepụtaraenyela iwu ka ndị ọrụ nche nwụchie mmanwụ ọbụla ji ụtali maọbụ ngwa ọgụ. Cheta na Afịaọlụ bụ emume ịgba mmanwụ na-eso owuwe ihe ubi ndị Nnewi na-eme kwa afọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 47365397,https://www.bbc.com/igbo/47365397,Imo State Election: 'Ndị otu Rochas tiri m ezigbo ihe ka m kpọọ ya onye mmeri' - Onye ọrụ INEC,Ibeawuchi Izuchukwu bụ onye chịkọtara vootu n'okpuru ọchịchị Ọlụ n'Imo steeti gwara BBC Igbo etu o si gabiga ihe ize ndụ n'aka ndị na-arụrụ gọvanọ Imo steeti ọrụ maka na ya ekwetaghị ka e degharịa mpụtara vootu a tụrụ ebe ahụ.,"Izuchukwu gwara BBC Igbo na gọvanọ Okorocha na ndị otu ya jidere ya, nye ya ego ma nye ya iwu ka o degharịa mpụtara ntuliaka ahụ mana oge ya jụrụ ime nke ahụ, ha ejide ya ma mesie ya ike. Lee ihe o kwuru n'onyonyo a. BBC Igbo gbara onye ọrụ Rochas, Ebere Nzewuji ajụjụọnụ mana o kwuru na ọ dịka Ibeawuchi natara ndị iro Rochas ego ka o kwuo ihe ndị ahụ niile. N'okwu ya: ""Ihe ndị ahụ o kwuru bụ okwu asị, ọ dịka ọ natara ndị pati ndị ọzọ ego iji kwugide ọga m"". N'aka nke ọzọ, BBC Igbo gbakwara onye ọrụ INEC Imo steeti bụ Odiziakụ Benson ajụjụọnụ mana o kwuru na ihe ahụ ka Ibeawuchi kwuru. N'akụkụ nke ya, onyeọrụ INEC n'etiti bụ Rotimi Oyekanmi kwuru na ha natara mkpesa gbasara ụfọdụ nsogbu e nwere n'ụfọdụ ebe n'Imo steeti mana ha anụbeghi maka okwu Ibeawuchi. O kwukwara na onye nchịkota vootu INEC na steeti ahụ erubeghi Abuja ịkọwa ihe mere. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-46698885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46698885,2019 Elections: Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ka anyị resi ha PVC,Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec etiela mkpu gbasara PVC ndị mmadụ anatabeghi na ihe ndị ndọrọndọro chọrọ ka ha mee.,"PVC ndị anatabeghị Kọmishọna Inec n'Oyo steeti akpọrọ Mutiu Agboke gwara ndị ntaakụkọ na ndị ndọrọndọrọ na-akwanye ha ọkụ n'ike maka ịzụta PVC ruru 914,529 nke ka dị ha bụ Inec n'aka. ""Inec kwudosiri ike n'ịhụ na ntuliaka 2019 ga-aga n'ụzọ kwụ ọtọ"" bụ ihe o kwuru. O ji kwa ohere ahụ rịọ ndị ntaakụkọ ha soro tinye anya n'ihe gbasara ntuliaka n'abịa n'afọ 2019. Inec ebidola okike akwụkwọ ntụliaka akpọrọ PVC mana ụfọdụ ndị mmadụ anatabeghi nke ha dịka ntuliaka 2019 n'abịa nso. Iwe ji ndị anatabeghị PVC n'Enugwu Akụkọ ndị ga-amasị gị" media-45493774,https://www.bbc.com/igbo/media-45493774,Paris Club Refund: Ajụjụ steeti gọọmentị kwesiri ịza,Okechukwu Okere bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara okwu ego gwara BBC Igbo na ego 'Paris Club Refund' gọọmentị etiti na-ekwe nkwa na ha ga-ekenye steeti di iche iche na Naịjirịa ga-ala n'iyi maọbụrụ na gọọmentị etiti agbaghị ndị steeti ajụjụ dị ezigbo mkpa.,"Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu. Cheta na gọọmentị etiti nyere mkpebi gbasara ọnọdụ steetị ọbụla na Naijiria gunyere nke ndị ala Igbo ga-anọ tupu ha esoro n'ime okike ego ahụ gọọmentị chọpụtara na mba France nke akpọrọ Paris Club Refund na bekee. Gọọmentị kwuru na ha ga-enye steeti niile ego ruru ijeri dọla abụọ na nde isi na asatọ ($2.68bn) dịka ego nke ikpeazu ha ga-anata n'ego a achọpụtara. Mana ministri na-ahazị ego Naijiria bụ Ministry of Finance na bekee ekwuola na ọbụrụ na steeti di iche iche emeghị ụfọdụ ihe, ha gaghị eso n'okike ego a. Kedu ihe a na-atụ anya n'aka ndị steeti a? Gọọmentị kwuru na steeti niile kwesiri ịkwu ego niile a jiri ndị ọrụ ha Steeti niile ga-agbakwa mbọ kwuchiete ego ha gbaziri n'aka gọọmentị n'afọ 2016 nke akpọrọ Budget Support Loans. Ọzọ bụ na Steeti niile ga-akwụchasị ego niile ha kwesiri ịkwụ na nkwekọrịta Presidential Fertilizer Initiative ha na gọọmentị nwere ka mgbe afọ garaaga. Ụfọdụ ndị ọrụ n'Imo steeti na-ekwu na gọọmentị ka jiri ha ụgwọ Ọnọdụ ọzọ bụ na steetị niile kwesiri ịnata ego ruru ha aka n'ime ngalaba Universal Basic Education Commission, gọọmentị na-ekwu na ego a ga-akwalite akwụkwọ primari na steeti di iche iche. Cheta na gọọmentị na steeti di iche iche na-enwe nsogbu maka ego ahụ kemgbe afọ 1995. Ajụjụ Okere na-ajụ? Okere gwara onye ntaakụkọ anyị na tupu ha ekenye ndị steeti a ego, gọọmentị kwesiri ịjụ ihe a ga-eji ego ahụ nwere mee. Ọzọ bụ na, o nwere uru ga-apụta na ihe a steeti gọọmentị dị iche iche ga-eji ego a mee? Nke atọ bụ na, steeti gọọmentị dị iche iche a ga-ekwe nkwa na ndị ga-achị n'ihu ga-akwado ebumnobi ha ebe ha tinyere ego ahụ. Mana Okere kwuru na ihe na-agbawa ya obi bụ na ọ cheghị na ndị gọọmentị ga-enwe ike ịza ajụjụ ndị a. Gọvanọ dị iche iche n'ala Igbo ha di njikere? Na mmemme ụbọchị ndị ọrụ ha mere n'afọ a, ndị ọrụ Imo steeti putara n'igwe na-ebe akwa na gọọmentị dị iche iche n'ala Igbo ka na-eji ha ọtụtụ ụgwọ ọnwa, nakwa ego ezumike nka akporọ ""pension"" na Bekee. Ipob malitere n'ala Igbo makana ọtụtụ mmadụ na-ekwu na gọọmentị etiti echefuola ndị Igbo Ndị ọrụ gara ezumike nka kwuru na ụbọchị ahụ na gọọmentị steeti ha ka na-eji ha ụgwọ ruru ọnwa iri atọ ruo iri ise na anọ. Ọtụtụ n'ime ha na-ebe akwa na ọdịghị mma na gọọmentị na-ebe ego ezumike n'ime ego ọnwa ha makana ego ahụ ezughi ezu. Mana gọvanọ dị iche iche dịka gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo na-ekwu na onweghị ụgwọ ọbụla o ji ndị ọrụ ya. Akụkọ ga-amasị gị 'Not to young to run' abụghị maka ogbenye ọnụ ntụ - APC" afirika-53893892,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53893892,Fani-Kayode enyela Daily Trust ịzuụka abụọ ịkwụ ya ijeri naịra isii maọbụ chere ya n'ụlọikpe,Onye okaikpe Femi Fani-Kayode agwala ndị ụlọọrụ Media Trust Limited bụ ndị nwe akwụkwọ akụkọ Daily Trusty ha bịa ka ha kpaa ka ha ga-esi kwụọ ya ijeri Naịra isii maka ịmetọ aha ya.,"O kwuru nke a n'akwụkwọ ọkaikpe ya degara onyeisi ụlọọrụ ahụ ụnyaahụ bụ ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ. Na ya bụ akwụkwọ nke onye ọkaikpe ya bụ Adeola Adesipe tinyere aka bụ ọsịsa akụkọ Daily Trust dere n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ bụ ebe ha kpọrọ FFK 'onye na-ese anwụrụike na-ezo onwe ya n'ezigbo uwe"". Onye dere ya bụ akụkọ ji okwu a saa FFK ahụ maka mkparị ọ kparịrị onye ọrụ ha bụ Charles Eyo na Kalaba dịka ọ jụchara ya ajụjụ ebe FFK si enwete ego o ji eme njem ọ na-eme na mpaghara ọdịdanyanwu. Onye dere ya bụ akụkọ kwuru na FFK bụ onye ""gara Mahadum Cambridge bụbu onye e ji anwụrụike mara, nakwa ọ gara nata ọgwụgwọ na mba Ghana mana ọ gbakebeghị."" N'ihi ya ka FFK ji sị ndị ụlọọrụ Daily Trust ha kwụọ ya ijeri naịra isii iji hichapụ ya bụ unyiri ha tere ya n'ihu ma dekwaa akwụkwọ rịọ mgbghara n'akwụkwọ akụkọ atọ, nke gụnyere nke ha. Ya bụ minista njem ụgbọelu ochie sị na ya nyere ha izuụka abụọ iji mee nke a maọbụ ha kee ajị n'ume chebiri ya n'ụlọikpe. Emechuola m onwe m na ezinụlọ m ihu Femi Fani-Kayode Femi Fani-Kayode, onye rụburu ọrụ ka mịnịsta na-elekọta njem ụgbọelu na Naịjirịa, arịọla mgbaghara pụrụ iche maka ịkparị onye ntaakụkọ. Ọ rịọrọ mgbaghara a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Uyo, isi obodo Akwa Ibom steeti. Fani-Kayode kwuru na ihere onwe ya na-eme ya maka etu ya si kpasa onye ntaakụkọ agwa. O kwuru sị: ""N'obi m niile, ana m arịọ mgbaghara maka etu m si gwa onye ntaakụkọ ahụ okwu."" ""Eji m ohere a na-arịọ ya, ka ọ gbaghara m, ejikwa m n'aka na ọ ga-agbaghara m."" ""Emechuru m onwe m, ndị ezinụlọ m na ndị enyi m ihu, nakwa ndị niile na-akwanyeburu m ugwu."" ""Onweghi onye ọchịchị maọbụ onye a ma ama kwesịrị ịkpa agwa etu m si kpaa agwa."" ""O wutere m, biko gbagharanụ m, agaghị m emekwa etu ahụ ọzọ."" Ụnụ azakwala oku Fani-Kayode kpọrọ - NUJ Femi Fani-Kayode na Gọvanọ Akwa Ibom bụ Emmanuel Udom Cheta na otu ọdịmma ndị ntaakụkọ na Naịjirịa nke Bekee kpọrọ ""Nigerian Union of Journalists"" (NUJ) nke Akwa Ibom steeti, dọrọ ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha ghara ịza oku Femi Fani-Kayode kpọrọ ha. N'akwụkwọ mgbasaozi onyeisioche na onye ode akwụkwọ NUJ n'Akwa Ibom binyere aka, ha sị na ha enyela iwu ka ndị ntaakụkọ niile gbajọọ oku Maazị Fani-Kayode kpọrọ n'ebe ọbụla na steeti ahụ. NUJ sị na ha esoghi na njem nleta Maazị Fani-Kayode na-eme ugbua. Amos Etuk bu onyeisioche NUJ n'Akwa Ibom ebe Dominic Akpan bụ Ode Akwụkwọ A gbagharala m Fani-Kayode maka mkparị ọ kparịrị m - Charles Eyo 'Ụdị mkparị Fani-Kayode nyere o nwebeghị onye nyere ya' Charles Eyo, onye ntaakụkọ Daily Trust Femi Kayode kparịrị n'ihe onye onye fegharịrị na social midia na nsonso ekwuola na o nwebeghị onye gwara ya ụdị okwu ahụ n'ụwa. Eyo gwara BBC Igbo na Femi Fani-Kayode kwesịrị izitere ya ozi mgbaghara ụdị ajọ okwu ọ gwara ya oge ha na-eme mkparịta ụka mana dịka onye ụka, na ya agbagharala ya. Cheta na okwu Femi Fani-Kayode bụbụ Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu gwara Maazị Eyo wuru ewu na soshal midia sị na ọ bụ ""onye iberibe"" na ọ na-ajụ ya ""ajụjụ iberibe."" Okwu ahụ mere ọtụtụ ndị mmadụ ịkwa Fani-Kayode emu ,ebe ụfọdụ gụnyere ndị nwelitere isi n'ọrụ ntaakụkọ kporo oku ka ọ rịọ onye ntaakụkọ ahụ. Maazị Eyo sị na ọ bụ maka etu ndị otu ya jiri tinye ọnụ na ya bụ okwu n'oge ihe mere kpatara ya jiri rịọ Maazị Fani-Kayode n'oge ahụ. Ọ gakwara n'ihu sị na ya ga-agbaghara makana ya bụ onye ụkọchukwu n'ụka a kpọrọ Brotherhood of the Cross and Star. Ndị ọrụ na-eru n'okwu banyere ntaakụkọ si Fani-Kayode rịọ ezigbote mgbaghara Ndị ọnụ na-eru okwu na ngalaba ntaakụkọ Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu Onye nwe ụlọọrụ ""The Cable"" bụ Simon Kolawale kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa anaghị achọ ka a jụọ ha ajụjụ tara akpụ, ya mere o ji adị ka ọ bụ ihe ọjọọ ka onye jụrụ ha mere wee jụọ ya bụ ajụjụ. O kwuru na udiri ihe a mee, na ọ dị mma ka onye ntaakụkọ ahụ kwụdosie ike n'ajụju ya ebe ndị otu ya kwesiri inye ya ezi nkwado. Tony Uranta bụ onye nlekọta Channels TV kwuru na Femi Fani Kayode kwesiri ịpụtakwa n'onyonyo ọzọ gosi ụwa ebe ọ na-arịọ Eyo mgbaghara. Onye ntakụkọ IBC akwụsịtụrụ ọrụ kparịrị gọọmenti- Kọmịshọna mgbasaozi Imo O kwuru na ajụjụ onye ntaakụkọ ahụ jụrụ dị mma nke mere ka Kayode kopu mana ọ dịghị mma etu o si tụwa egwu mgbe Kayode bawara ya mba. O kwuru na onye ntaakụkọ ọbụla kwesiri iji ọrụ ya na-eme ngala. Abia n'ebe onye nwe ụlọọrụ nke Kayode kwuru ka ọ gwa ka ọ chụọ Eyo, Uranta kwuru na onyeisi ahụ kwesiri ịma na ọ bụ ọrụ ka Eyo na-arụ ghara ị danyere Kayode. Femi Fani Kayode arịọla Charles Eyo ọ kpọrọ onye nzuzu mgbaghara Femi Fani-Kayode arịọla Charles Eyo bụ onye ntaakụkọ mgbaghara maka mmebọ o mebọrọ ya mgbe ọ jụrụ ya ajụjụ n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ o kpokọbara na Calabar. Kayode depụtara mgbaghara na twitter ya ma na-ekwu na o nweghị mgbe o ji kwuo na ọ ga-ememina Eyo. O kwukwara na ọ ma na-agwa ya akpasuola ọtụtụ ndị mmadụ iwe mana ọ kpofuola ihe ahụ merenụ ma na-aga n'ihu ime njem ngagharị ya n'ọwụwa anyanwụ. ""Ihe ọbụla mere Charles Eyo, onye ntakụkọ anyị dị n'isi Femi Fani-Kayode""- Daily Trust Cheta na ụlọ ọrụ Media Trust Limited, ndị na-edepụta akwụkwọ ozi Daily Trust katọrọ etu Femi-Fani Kayode si were ọnụ yọchaa onye ntaakụkọ ha bụ Charles Eyo n'onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia. Ihe a mere na Calabar, Cross River State n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ n'ụlọ oriri na nkwarị ebe Kayode na ndị ntaakụkọ na-enwe mparịtaụka. Ha kwuru na obi adịghị ha mma na ebechapụrụ ajụjụ onye ntaakụkọ jụrụ kpatara ọsịsa ahụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite kparịwa Eyo. Ha na-ekwusi ike na ha kwadoro Eyo n'ihe o mere maka na ọ bụ ọrụ ya ka ọ na-arụ. Daily Trust kwuru na ihe Kayode mere Eyo gosiri na o nweghị nkwanye ugwu nye ndị ntaakụkọ. Ha jịkwa ohere a agwa ụwa na ihe ọbụla mere Charles Eyo ugbua bụ n'isi Kayode ka ọ dị maka etu o si gwa ya okwu ike. Ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a mere n'elu soshal midia. Ihe m jụrụ Fani-Kayode kpasuru ya iwe- Onye ntaakụkọ 'Daily Trust' Femi Fani Kayode: Ihe m jụrụ ya gbawara ya obi Onye ntaakụkọ Daily Trust bụ Charles Eyo kọwara ihe butere mkparị Femi Fani Kayode bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu nyere ya n'ihe onyonyo na-ewu ewu na soshal midia. N'ihe onynyo ahụ, Femi Fani-Kayode ji iwe bara onye ntaakụkọ Eyo mba sị ya na ọ na-ajụ ""ajụjụ iberibe."" Na mkparịtaụka BBC na onye ntaakụkọ ahụ nwere n'ekwentị,o kwuru na ajụjụ ya juru so n'ihe Fani Kayode gwara ha bụ ndị ntakụkọ ọ kpọrọ oku na ya agaala leta ọrụ iri atọ na atọ nke Gọvanọ Ben Ayade nke Krọs Rịva rụrụ were hụ na ọ dị mma, maa gakwa hụ ihe gọvanọ steeti isii ndị ọzọ rụrụ. ""M were jụọ ya sị, ""Ị gwabeghị anyị onye na-akwụ ụgwọ njem ndị a ị gara?"" Ya bụ ajụjụ mere ka Femi Kani Kayode gbakaa ma bara ya ezi mba kwee nkwa ịkpesara ndị nwe ụlọọrụ Daily Trust. Eyo gbara ama na dịka Fani Kayode kwere nkwa ịchụ ya n'ọrụ n'ihe onyonyo ahụ, na ọ kpọrọ onye nwe ụlọọrụ ha ma gwa ha ka ha chụọ ya n'ọrụ mana ha achụghị ya. O kwuru na onyeisi ọrụ ya ewepụtaghị akụkọ ihe ahụ mere n'ụbọchị Tọzde dịka ya wegara ha akụkọ ahụ. Kama na ha mechara rịọ ya mgbaghara oge ihe onyonyo ahụ bidoro wuwe na soshal midia. Eyo gara n'ihu kwuo na o wuteghị ya na ya jụrụ Fani Kayode ajụjụ ahụ, kama na ihe wutere ya bụ na ya sị Fani-Kayode ya ewela iwe ka ya jụchara ya bụ ajụjụ." media-45313305,https://www.bbc.com/igbo/media-45313305,Ụmụaka abụọ awụọla n'Ebonyi maka kerosene adigboroja,Ụmụaka abụọ awụọla n'Ebonyi,Ụmụaka abụọ anwụọla n'Ebonyi steeti maka mmanụ kerosene adigboroja dị n'ime mpanaka gbawara na bee ha. Ha abụọ bụ nwanne na nwanne dị afọ asaa na afọ ise. Akụkọ a kwukwara na ọkụ rekwa onye ọzọ nọrọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ndị uweojii ekwuola na ha emechiela ụlọọrụ rere mmanụ a. Akwammiri adaala na Niger steeti. Akukọ na-ekwu na akwammiri a nọrọ n'okporụzọ Mina na Bida dara maka nnukwu ozizo mmiri na-ezo ugbua na steeti ahụ. John McCain ala!! Ọrịa kansa egbuola otu Sinatọ ama ama nke ala Amerika aha ya bụ John McCain. McCain dị afọ iri asatọ na otu oge ọ nwụrụ n'isi ụtụtụ taa. N'egwuregwu Aka na-achịkota otu egwuregwu Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na nnukwu ọrụ ka dị n'aka ya na-agbanyeghi na Liverpool meriri Brighton otu ọkpụ na-asataghị ihe. Cheta kwa na Chelsea na Newcastle nakwa Crysal Palace na watford ga-asọmpị nke ha taa na Premier league. Gee nkeji anyị nle ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti media-52006879,https://www.bbc.com/igbo/media-52006879,Coronavirus: 'Anyị ga-eji 'Mobile App' ahụ na ụmụakwụkwọ mere ihe omume enyere ha',Iwu mmechi gọọmentị nyere ka ụloakwụkwọ mechie biara na mberede nye ndị ụlọakwụkwọ maka ọrịa coronavirus.,"Mkparịtaụka BBC na onye isi ụloakwụkwọ 'First Nuture' bụ Chidinma Nwoke na nke 'Great Lawra Wood School Queens Hall' bụ Ngozi Ikoro gosiri ihe ha na-eme ka ha ọmụmụ ụmụakwụkwọ ha na-aga n'ihu. Ha kọwara na na-agbanyeghị na mmechi a bịara na mberede, ha ga-eji ihe dịka Whatsapp na mobile App akụzịrị ụmụakwụkwọ ihe dịka ha nọ n’ezumike. Ha rịokwara nne na nna ka ha nyere aka ị hụ na ụmụ ha mere ihe omume e nyere ha n’ụlo akwụkwọ n’oge ezumike a." afirika-47871371,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47871371,Dr Onye Mmemme: Ọ na-afụ ụfụ n'ahụ mana ọ na-enye m ọṅụ - Ote egwu,"""Ndụ a anyị na-ebi pere mpe, mana ọ bụ egwu ka m ji aka"".",Nwafọ Igbo bụ Nnaemeka Nweke kwuru nke a iji kọwa ịhe mere o ji tikwasa ịgba egwu na ọrụ dọkịnta bekee ọ na-arụ. O kwukwara na ọ naghị agba ya na nkịtị makana ndị mmadụ na-akwụ ya ezigbo ụgwọ ka ọ gba egwu na mmemme ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: media-44271446,https://www.bbc.com/igbo/media-44271446,Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ugbu a,Ọnwa Mee 27 n'afọ ọbụla bụ ụbọchị pụrụiche ekewapụtara maka ncheta ụmụaka niile nọ na Naịjirịa na ihe gbasara ha.,"Dika a na-eme emume ụbọchị ncheta ha nke afọ 2018, ụmụaka Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ ka gọọmentị etiti mere ha. Gọọmentị etiti nakwa ngalaba na-ahụ maka ụmụaka na mbaụwa niile akpọrọ UNICEF ekwuola na ha ga-eme ihe niile ike ha ruru iji wee kwụsị mwakpo ụmụaka . Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53410811,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53410811,Chiamaonwu Joy: Eji m eserese m mụtara na YouTube egosipụta omenala Igbo,Chiamaonwu Joy na-ese ụdị eserese a na-akpọ 'hyper realistic drawing'. Ọ kọwala ihe omimi dị n'ụdị ihe ọ na-ese.,"Ọ sị na ọ malitere ise ihe mgbe ọ dị naanị afọ isii, na o nweghi ụlọakwụkwọ ọ gara mụta ya kama na ọ bụ n'ịntanet. Nwada a sị na ọ bụ onye na-ese ihe banyere ọdịnala nke ọ na-eji egosipụta ọtụtụ ihe omimi dị n'omenala Igbo. Chiamaonwu sị njirimara ihe osise ya bụ okpokoro ejula nke mere o ji pụọ iche na ndị ọzọ. Ọ sị ihe mere o ji eji okpokoro ejula bụ maka na ọ bụ otu n'ime ihe ndị dibia ji agba afa. Kirie ihe o kwuru n'uju." afirika-43705691,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43705691,Ọgbaghara obidola na Ohaneze ọzọ?,"Ndị kọmitii Ohaneze ndị Igbo hibere maka itinye anya n'okwu na-esi n'etiti ndị isi, ụmụntorobịa na otu ụmụnwaanyị ha ekwuola na ọ bụ nndị isi oge ka kwụrụ chọrọ ka e tinyekwuoro ha oge n'oge ọchịchị ha bụ aka enwe dị n'ofe dịka o siri gbasara nsogbu otu ahụ na-enwe ugbua.","Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Nke a so n'ihe pụtara na nchopụta ha nwere nsonso a. Na mkparịtaụka ya na BBC Odeeakwụkwọ kọmitii ahụ bụ Okpani Nkama kwuru na ọ bụ ntuliaka ndị ogbo (Youth Wing) na-erute bụ ihe bụtere anwụrụọkụ ahụ na-akwụ. Ọ gara n'ihụ kọwa na ndị ọchịchị ogbo ntorobia na nke ụmụnwaanyị a ekwesirilarị ịrịda na-ochịchị dịka iwu Ohaneze siri kwuo. ""Mana ihe ọgụ na mgba na ebubo niile a ị na ahụ bụ ka ka agbara ị ya bụ ntụliaka na ọgụ mgbụrụ ụbọchị nke Epurelụ."" Cheta n'abalị ole na ole gara aga, onyeisi ndị otu ogbo nke Ohaneze bụ Okechukwu Isiguzoro zigara ndị ntaakụkọ akwụkwọ ebe ha naọ kwuọ na ha na achụtu onyeisi Ọhanaeze n'ihi ihe ha kpọrọ ""ọchịchị aka ike"". Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45268086,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45268086,Third mainland: Anyị ga-ata ahụhụ,Ụfọdụ ụmụ Igbo bi na Legọs akọwaala ụdị ahụhụ ha ga-ata ma ọ bụrụ na emechie akwammiri 'Third mainland' dịka gọọmentị si kwụọ.,"Gọọmentị Legọs steeti kwuru na a ga-emechi akwammiri 'Third mainland' site n'abalị iri abụọ na atọ ue iri abụọ na isii nke ọnwa Ọgọstụ nke afọ a. Ha kwuru na nke a bụ iji mee nyocha n'akwammiri a tupu ha na-arụ ya ọrụ na ngwụcha afọ ma ọ bụ mmalite afọ 2019. N'ajụjụ ha zara BBC Igbo, ọtụtụ ndị Igbo bi na Legọs etiela oke mkpu na nsogbu chere ha n'ihu ma ọ bụrụ na emechie ya bụ akwammiri 'Third mainland'. Ọ bụrụ na i bi na Legọs, tụlee maap a ka ị mara ụzọ ndị ọzọ ga-esi ma ọ bụrụ na e mechie akwammiri 'Third mainland' ka ọ dịrị gị mfe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43017683,https://www.bbc.com/igbo/43017683,"Lassa Fever: Otu awụọla, mmadụ iri abụọ na otu nọ n'ụloọgwụ",Ọrịa lassa egbuola otu onye na Taraba steeti.,"Anambra steetị butere iwu machiri ịṅụ garri na steeti ha Dokịnta Aketemo Udi bụ onye akpọrọ 'Epidemiologist' n'olu bekee gwara ndị ntaakụkọ na ọbụghị mmadụ atọ nwụrụ dịka ụfọdụ ntaakụkọ dere. Udi kwuru na ọ bụ ọrịa ọzọ gburu mmadụ abụọ n'ụbọchị ole na ole garaga. ""Ugbu a, mmadụ iri abụọ na otu bụ ndị na-eme ka ha nwere ọrịa lassa. Mana sọọsọ mmadụ ise ka anyị ma nwere lassa n'ime ha. Otu n'ime ha awụọla. Ugbu a, anyi na-eche akwụkwọ ga-egosi ma mmadụ asatọ ọzọ o nwere ọrịa lassa."" Udi kwuru na sọọsọ ebe akpọrọ 'laboratory' n'olu bekee ga-enweike inyocha ma ọrịa ọbụla mọọbụ lassa, maka na oyiri ọrịa ndị ọzọ dịka Dengue fever na Yellow fever, Udi kwuru. Steeti ndị nwere Lassa Kemgbe afọ 2018, Naijirịa enweela ọrịa lassa ruru ihe dịka otu narị na asatọ. Ọria nke a abaala steeti dika Edo, Ondo, Bauchi, Nasarawa, Ebonyi, Anambra, Benue, Kogi, Imo, Lagos na Taraba. Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ ruru ihe dika mmadụ iri na steeti anọ Ebonyi, Nasarawa, Kogi na Benue nwere lassa." 44725342,https://www.bbc.com/igbo/44725342,Buhari ebinyela aka n'iwu ịkpachi ego Naijiria e zufuru,Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ ka gọọmenti nwee ikike ịkpachi akụ na ihe onwunwe ndị a na-arụ aka imefu ego Naijiria.,"Ibuso nrụrụaka agha so na nkwa Muhammadu Buhari kwere na ọchịchị ya ga-arụ tupu ọ banye n'ọkwa onyeisiala Iwu ọhụrụ ahụ kwuru na a ga-ejichi ihe niile nwaafọ Naijiria bụ onye ọrụ gọọmentị maọbụ onye nọ n'ọkwa ọchịchị nwere n'ala Naijiria ruo mgbe ikpe gbasara ya biri n'ụlọikpe. Onyeisiala Buhari kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter, kwuru na nke a bụ iji kwudosie ike n'ọgụ megide nrụrụaka iji hụ na ndị tinyere aka na mpụ alaghị n'efu. O kwuru na iwu ọhụrụ ga-anapụ ndị tinyere aka na mpụ akụ ha kpatara n'ụzọ akwụghị ọtọ, iji gbochie iji ya eduhie ndị na-eme nnyocha maọbụ ikpe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44425333,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44425333,Ịkpa oke agwa: Ọ na-akara ụmụnwaanyị ndị isiojii dị ọcha mfe n'ọrụ ihe nkiri?,"Rihanna, Beyonce, Cardi B, Stefflon Don, Maya Jama, Mabel, Zendaya na Adwoa Aboah.","Ndị a bụ ụfọdụ ụmụnwaanyị nọ n'elu ihe ha na-eme n'ụwa niile gbasara ihe nkiri n'afọ 2018. Mana agamnihu ha mkpụrụ ole bụ maka agwa ahụ ha? Ụfọdụ ụmụnwaanyị isi ojii ekwuola na ndị dị ọcha n'ime ha na-aka aga n'ihu ọsịsọ maka ịkpa oke agwa. Ịkpa oke agwa bụ ekworo megide ndị dị ojii na/maọbụ ịka meta ndị dị ọcha n'otu agburu ahụ nke ọma. Ọ bụ otu ihe onye a ma ama bụ Lioness kwuru na ya gabigara. Lioness kwuru na ya kwụsịrị ime ihe ya hụrụ n'anya ime maka ịkpa oke agwa Ọ gwara Newsbeat na ọ kwụsịrị ịgụ egwu afọ asaa ma otu ihe so n'ihe o ji kwụsị bụ maka ekworo a na-ekwosa ya maka na agwa ahụ ya dị ojii. ""A$Rs [ndị na-achọ ndị nwere onyinye pụrụiche] ga-ekwu ihe dịka: 'Ọ kara ịka mma ma ọ bụrụ na ọ dị ọcha' - okwu ahụ enweghi dị m isi na ntị. ""Ama m ihe ha na-achọ ikwu, ọ bụrụ na m dị ọcha, akara m ịka gaa n'ihu. ""E bido na-agwa gị ụdị ihe kwa nkeji ọbụla, ma m bụ obere nwa oge ahụ, ọ masịghị chaa. ""M wee kwụsị ime ihe m hụrụ m'anya maka ndị mmadụ gara n'ihu na-ekwu maka agwa ahụ."" 'Ohere ndị dị ọcha' Okwu gbasara ịkpa oke maka agwa ahụ bolitere ọhụrụ oge Maya Jama kwuru okwu gbasara ya site n'okwu ọchị o kwuru na twitter n'afọ 2012 ebe o mara ụmụnwaanyị isiojii akaja. Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia na-ekwu na ya bụ onye na-arụ na Redio 1 bụ naanị ohere ndị dị ọcha bụ ihe nyere ya aka. Nna Beyonce bụ Matthew Knowles kwuru na mbido afọ a na ndị isiojii dị ọcha na-aka ewu ewu. O kwuru na nwa ya na-ewu nke ukwuu maka na ọ dị ọcha ma kwuo na onweghi onye na-akụ egwu a ma ama bụ onyeisi ojii pụtarala ma gbawa ụzọ n'afọ iri gara aga. N'ime ụmụnwaanyị 68 ndị na-agụ egwu nọ n'isi ọnụọgụgụ ndị na-ewu ewu na Briten, mmadị 17 n'ime ha bụ ndị isiojii ma ọkachasị n'ime ndị ahụ dị ọcha. (L-R) Beyonce, Sza, Raye, Rihanna, Cardi B, Ella Eyre, Kelli-Leigh na Stefflon pụtara n'ime ngụkọ egwu 10 na-ewu ewu kemgbe 2017 Kelli-Leigh onye nne ya bụ onye isiojii ma nna ya bụ onye ọcha rigoro n'ogo nke 10 n'afọ gara aga n'egwu James Hype a kpọrọ 'More Than Friends.' O kwuru: ""Maka ihe a na-amabeghi, ụzọ ka mechikwara emechi nye ụmụnwaanyị ndị isiojii na-eme ihe nkiri na mba UK ndị ahụ ha dị ojii n'ihe gbasara agwa...o kwesighi ịbụ maka agawa ahụ anyị, o kwesiri ịbụ maka ndị anyị bụ."" N'afọ 2017, Ray BLK tutu ugo nke ndị BBC a kpọrọ 'Sound of Music' mana ọkabeghi ruo n'ogo nke 40 na ndepụta nke egwu na-ewu ewu - dịka Jorja Smith na Raye bụ ndị nọkwa na ndepụa ahụ. Nke a ebutela ajụjụ ma agwa ahụ ha eso n'ihe mere ha ji gaa n'ihu. Nicole Vassell, odeakwụkwọ ihe nkiri na ihe ngosipụta n'akwụkwọ mgbasaozi Pride Magazine nke bụ maka ụmụnwaanyị isiojii kwuru na: ""O nwere ihe kpatara na ọtụtụ ndị na-achawapụta na ndị kachasị bụ ndị isiojii dị ọcha. ""Ndị dịka Beynonce na Rihanna, eziokwu ha nwere onyinye pụrụiche ma marakwa ihe ha na-eme ma ọcha ha dị sokwa wee nyere ha aka n'ebe ha nọ ugbua. ""E nwereike inwe ụmụnwaanyị ndị ọzọ dị ojii ma nwekwaa ụdị onyinye ahụ mana anyị agahị ama maka na a naghị enye ha ụdị ohere maọbụ lee anya n'akụkụ ha."" Ndị ọkachamara na-atụ aka n'ịkpa oke agwa dị n'ime mgborogwu agụgụala nakwa ikpa oke agbụrụ ma ndị mmadụ oge ụfọdụ na-anata mmegbu n'aka ndị dịkwa ka ha. Dọkịnta Kehinde Andrews, otu onye na-achọ ịbụ onye ọkammụa na 'Sociology na mahadum Birmingham City nakwa ọsọ bụrụ onyeisioche otu ndị isi ojii kwuru na: ""Ọ bụrụ na anyị chee echiche banyere atụmatụ mma na ihe dị mma, ịkpa oke agbụrụ dị n'ime atụmatụ ahụ na e nwere ọkwa, ndị Amerịka isiojii nọ n'ala ebe ndị mpaghara Yurop dị ọcha nọ n'elu. ""Nke pụtara na ọ bụrụ na ịnọghị ojii nso cha cha, ọ bụrụ na ị nọ ịdị ọcha nso, e kwuola nọ ọ bụ ya bụ mgbe ị dị mma, ịnwghi ntụpọ, ị mara mma, ị mara akwụkwọ."" 'Ụbọchị niile adị m nnọ ojii etu m dịkwa ụbọchị bu ya ụzọ' Arụmụka dị n'akụkụ ịkpa oke agwa abanyela n'akụkụ ndị ọzọ na-eme ihe nkiri. N'ihe onyonyo, ụmụnwaanyị dị ojii ndị nwetara agwa buru ibu n'ime onyonyo 20 kachasị ree na UK n'afọ 2017 gụnyere Zoe Saldana, Tessa Thompson, Halle Berry, Elise Neal na Nathalie Emmanuel. Ị lee anya n'akwụkwọ magazin, magazin ụmụnwaanyị anọ kachasị ere bụ (Cosmopolita, VOgue, Grazia na Marie Claire) enwela ụmụnwaanyị ndị isi ojii a ma ama mmadụ itoolu n'ihu peeji ha dị 125 nke ha wepụtara kamgbe ọnwa Jenuwarị 2017. Ụmụnwaanyị ndị a bụ Rihanna, Meghan Markle, Beyonce, Adwoa Aboah, Lupita Nyong'o, Zoe Kravitz, Zoe Saldan, Jennifer Hudson na Gugu Mbatha-Raw. Dọches Suseks kwuru okwu banyere ịkpa oke agwa n'afọ 2015 ebe o kwuru na dịka onye na-eme ihe onyonyo, a na-ahụta ya dịka 'onye amaghị ebe o si"". Oge o na-ede n'akwụkwọ magazin Elle, o kwuru na otu ihe agwa o mere dịka Rachel Zane n'ihe onyonyo Amerịka a kpọrọ ""Suits"" jiri rie ya isi bụ maka na ọ bụghị maka agwa ahụ onye na-eme ya. Ndị mere ihe onyonyo ahụ achọghị onye a gwara ọgwa, maọbụ onye ọcha maọbụ onye ojii. ""Ha nọ na-achọ naanị Rachel."" (L-R) Zoe Kravitz, Zoe Saldana, Lupita Nyong'o, Adwoa Aboah, Gugu Mbatha-Raw na Jennifer Hudson anọọla n'ihu magazin kachasị na UK kamgbe afọ 2017 Onye so mee ihe nkiri 'Star Wars' bụ Lupita Nyong'o ekwupuola etu esi akọ ya ọnụ na 'agwa ahụ ya dịka uchichi' ebe ya na-ekpere Chukwu ka ya teta ụra n'ụtụtụ dịtụ ọcha. ""Kwa ụbọchị, ana m enweta obi mgbawa maka ana ma adị ojii ka m dịkwa ụnyaahụ."" Onye na-eme ihe onyonyo bụ Adele Oni mere agwa onye ose foto na ihe onyonyo nke Briten na-abịabịa a kpọrọ 'No Shade' nke bụ maka ịkpa oke agwa na ịhụnanya. Adele, bụ onye pụtara na 'No Shade' kwuru na ịkpa oke agwa bụ ""akụkọ anyị anaghị akọ"" O kwuru na: ""Anyị niile mara etu o si baa n'ime ụmị ụwa anyị, atụmatụ ịkpa oke agwa na atụmatụ itolite ma ghọta na ọbụrụ na ị dị ọcha, na ị ka maa mma n'anya ụmụnwoke, ka anyị nabatara. ""Onweghi mgbe anyị gbara ọkụ na ya ma gosipụta ihe ọ bụ maọbụ ihe ịtụ n'anya ụdị nsogbu ọ bụrụ anyị."" ""E nwere mgbanwe"" Anabatala ndị nkiri na ndị mgbasaozi nkeọma n'oge adịghị anya maka na-agbasa aka karịa ugbua. Edward Enninful, bụ onye odeakwụkwọ mbụ nke magazin briten Vogue bụ onyeisi ojii were oche n'ọnwa Ọgọstụ afọ gara aga ebe nke ha bipụtara n'ọnwa Mee gosipụtara ụmụnwaanyị nwere agwa dị icheiche. Ma e toro ihe nkiri 'Black Panther' nke Lupita Nyong'o na Letitia Wright so na ndị mere ya maka na o gosipụtara ụmụnwaanyị nwere agwa ojii. Onyeisi ụlọọrụ Liz Matthews PR bụ Jordan Mitchell kwuru na arụmụka dị n'akụkụ atụmatụ ịkpa oke agwa na-emegide ụmụnwaanyị ndị isiojii oge ụfọdụ. ""O zughu inwe mmadụ onyeisi ojii mana ọ bụ maka ụdị agwa ojii nke ka mma."" O kwuru na ihe e kwere ime bụ ikele ndị ọrụ nkiri maka na ha na-anabatazi mmadụ niile. ""Ama m na oge mbụ ụdị mmadụ Halle Berry bụ naanị onye a ga-eweta dịka onyeisi ojii, nke ahụ agala. ""Ebe m mara na e nwela ọtụtụ ụmụnwaanyị isi ojii nwere agwa dị icheiche, nke a gosiri na e nweela mgbanwe ma ihe na-aga n'ihu."" Lioness tiputara ntigharị egwu DBT nke bụ 'Dead Black Tin' na Bekee na mbido ọnwa a nke nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ezigbo ojii n'ime ya dịka Lady Leshurr na Little Simz iji megide ndị na-akpa oke agwa. O kwuru na ọ na-emezi emume maka ya dị nnukwu ojii na chọkwa ka egwu ahụ ""metụta na anyị niile bụ otu agbụrụ agbanyeghi ụdị agwa onye dị."" ""Ọ dị m ka, ngwanụ ka anyị mee ya bụ ihe, Ị na-agbalisi ike ịkwụsị m maka etu ahụ m dị, nsogbu adịghị, ngwanụ ka anyị kwata ya."" ""Aga m agbawa ụzọ niile m nwereike icehta."" Soro Newsbeat na Instagram, FacebooknaTwitter. Gere Newsbeat live at 12:45 na 17:45 kwa izu na BBC Radio 1 na 1Xtra - Ọ bụrụ na i geghi anyị, inwere ike inweta anyị nahere." 45160509,https://www.bbc.com/igbo/45160509,"Nwata kụọ ogene, ọ kụgbughị nne ya, ọ kụgbuo nna ya - Ọkụ ogene",Ị ma ihe mere onye nne ya na nna ya nọ ndụ adịghị akụ ogene mgbasa ozi n'Igbo?,"Fabian Ike gwara BBC Igbo ihe kpatara ya nakwa etu o siri bido ịkụ ogene. Maazị Ike gara n'ihu kwuo na ọghọm dịkwa n'ọrụ a, dika dibia izuru olu onye ogene na ihe ndị ọzọ. Gee ya ntị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52458112,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52458112,Coronavirus Tips: Gee ntị na ndụmọdụ si n'ọnụ ụmụntakịrị,Ọrịa coronavirus emeela ụwa niile ahụnanya ekwe.,"Ma okenye ma nwata, o nweghị ndị ya bụ ọrịa hara. Lee etu ụmụntakịrị si kọwaara BBC Igbo ihe ha ghọtara gbasara ọrịa a nakwa etu a ga-esi zeere ya. Onye mere ya bụ Ebere Ekeopara." afirika-43854700,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43854700,Unicef: Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ,Otu mba ụwa na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka nke a kpọrọ Unicef n'aha ịchafụ ekwuola na ụmụaka ruru puku 88 nọ n'etiti ọnwụ na ndụ n'ihi ọrịa erighị nri nke ọma nke a kpọrọ 'Severe Acute Malnutrition' na bekee.,"ọtụtụ ụmụaka na ụmụnwaanyị dị ime na-arịa oke agụụ nmpaghara ugwu-awusa ebe ndị Boko Haram na-akpa ike Oke agụu a dị na mpagara Ugwu Awụsa ebe ndị oyiegwu Boko Haram na-akpa mkpamkpa. Ihe dịka otu nde ụmụaka dị bido n'ọnwa isii rue ọnwa iri ise na itoolu na steeti Borno, Adamawa na Yobe ebe ndị Boko-Haram na-akpa mkpamkpa na-arịa oke agụụ. Onyeisi ọrụ Unicef na Borno steeti bụ Geoffrey Ijumba, kwupụtara na Maiduguri na mmechi ọgbakọ nkuzi abali ise maka ihe mmadụ na-eri nke ha mere, na otu n'ime ise ọbụla na ụmụaka puku 440 na-arịa oke agụụ nọ n'etiti ọnwụ na ndụ ma ọ bụrụ na ha enweghị ezi nleta. O kwukwara na ụmwụnwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara dị puku narị abụọ, na iri atọ (230,000) na arịkwa ọrịa erigh ezi nri, ebe otu nde na ọkara mmadụ enweghị ezi mmiri ọṅụṅụ na Borno, Adamawa na Yobe steeti. Ọ gwara ndị sonyere n'ọgbakọ nkuzi ahụ ka ha kwado mbọ steeti na-agba iji nyere ụmụaka aka ka ha nweta ezi nri ga-eme ka ha too ma mụta akwụkwọ ọfụma iji nyere obodo ha aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42864323,https://www.bbc.com/igbo/42864323,Enweghi njikere butere mgbasa ọrịa lasa fiva- NMA,"Ndị otu dibia bekee n'ala Naijiria a na-akpọ, NMA, n' aha ịchafụ ekwuola na ọrịa lasa fiva na-agbasa ala Naijiria niile bụ maka na Naijiria enweghi njikere i kwụsị ya bụ ọrịa.","Lasa fiva egbuola ọtụtụ mmadụ gunyere ndị ọrụ ahụike NMA kwukwara na gọọmenti kwesiri ileba anya n'ulọọgwụ niile dị na ala Naijiria inwe ikike ikwusi ọrịa lasa fiva. Ha rịọkwara ndị mmadụ ka ha ga ụlọọgwụ ozigbo ha hụrụ akara na-egosi onye na-arịa ọrịa lasa fiva dịka iba, isi owiwa, ike ọgwụgwụ, ukwara weredirigaba. Ha kwukwara na ọ dị mkpa ka mmadụ niile chekwa nri a dịka garri na mkpụrụ dị ichiche n'ime ọgbọ. Ha gosiri ọmịiko maka ndị niile nwụrụ n'ọria lasa fiva na Naijiria na afọ." afirika-44036847,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44036847,Akụkọ kachasị taa: A tọpụla onye Jamini a tọrọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"................... Buahri na-aga London taa. O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya. Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem. O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ. NAFDAC emechiela ụlọọrụ Emzor na ndị ọzọ. Ndị NAFDAC emechiela ụlọọrụ atọ atọ na-emepụta ọgwụ, ụlọọrụ ndị a bụ Peace Standard, Bioraj na Emzor Pharmaceuticals. Onyeisi ndị NAFDAC bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuru na ha mere nke a oge ha mesịrị nyocha n'ụlọọrụ ndị ahụ nke so nchọpụta BBC gbasara ọgwụ codeine. A tọpụla onye Jamini a tọrọ Ndị uweojii kwuru na ha agbapụtala Cremza onye a tọrọ izuụka ole na ole gara aga. A tọpụtala otu ịnjinia onye Jamịnị aha ya bụ Michael Cremza, na-arụrụ ụlọọrụ Dantata na Sawoe nke ndị ojiegbe tọrọ n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Epreelụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ, SP Musa Majia, gwara onye ntaakụkọ BBC na nwoke ahụ ndị uweojii gbapụtara na-enweta nleta na ụlọọgwụ. Zambia achọghị ka ụmụakwụkwọ ha na-agba ọtọ Ndị isi otu mahadum na mba Zambia adọọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ha aka na ntị ka ha kwụsị ịbụ oyi akwa gbọ ọtọ. Ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ dere akwụkwọ ha biri n'akụkụ ọbaakwụkwọ ha gwa ụmụnwaanyị ha ka ha ghara kwụsị igosi ahụ ha maka na ọ na-agharịpụ ụmụnkwoke ha. Na mba ofesi Trump ga-ekwu uche ya gbasara nkwekọrịta Iran gbasara ngwọagha nuklịa taa. Na mba ofesi onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ga-ekwu taa ka ọ ga-agbahapụ nkwekọrịta ya na Iran mere gbasara imepụta ngwọagha nuklịa. Mba Yurope, China na Rọshịa na-agbakiri ala kamgbe ịhụ Amerịka ewepụghi aka na nkwekọrịta hụ nke e kwuru nwere ike ibuta agha mbaụwa ọzọ. N'egwuregwu N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Real Madrid na-ele anya na Ronaldo ga-adị mma ịlaghachite n'asọmpi Champions Lig ọzọ. Nke a bụ maka ahụ o merụrụ ụbọchị ụka oge ha na otu Barcelona zutere. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha. BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ịchọpụta ndị ma asụ Igbo ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-46630155,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46630155,"National Security: Tupu ị gbara lawa Ekeresimesi, gụọ akụkọ a!","Ka oge ekeresimesi ruru, ụfọdụ ndị nwere ohere ilaru ụlọ (ọkachasị ndị si mba ofesi) na-atụ ụjọ etu ha ga-esi laa n'udo ma lọghachite na-enweghị ndị zuru ha ohi maọbụ tọrọ ha.","N'ime afọ ole na ole gara aga, e nweela ụfọdụ ọmụmatụ ndị lọtara ekeresimesi lọkwute ọnwụ ha. Nke mere n'Imo steeti n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2017, ebe a gbagburu Chuks Okebata bụ onye agha na mba Amerịka, so tinye ụjọ n'ahụ ụfọdụ ndị bi na mba ofesi. E nwekwaala ndị nke a tọrọla iji napụta ndị nwe ha ego mgbapụta, ma nwee ndị nke e zuru ohi, nakọrọcha ha ihe niile ha ji lọta. Gịnị ka ị ga-eme iji chekwa onwe gị? A bịa na nchekwa, gọọmentị Anambara steeti kwuru na ha agbaala mbọ ịhụ na agaghị anụ akụkọ na-ada aja aja na ntị banyere ndụ ndị mmadụ n'oge ekeresimesi a. Na websaịt ndị uweojii Naịjirịa, ha depụtara usoro ị ga-eji chekwa onwe gị na ezinaụlọ gị. Ụzọ a na-akpọ ""Abia Tower"" n'Abịa steeti. Ndị Igbo na-ala ekeresimesi ọfụma n'agbanyeghị ma ego ụgbọala ọ nọ n'elu ọjị Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-43222495,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43222495,FA: Swansea eruola agba nke anọ nke mbụ ha n'ime afọ 54,"Ndị otu egwuregwu Swansea ji ọkpụ abụọ merie Sheffield Wednesday, nke mere ka ọ bụrụ mbụ ha na-erute n'agba nke asatọ nke iko FA kamgbe afọ 1964.","Swansea banyere asọmpi Premier League n'afọ 2011 Jordan Ayew nyere goolu nke mbụ na nkeji 15, ka Nathan Dyer nyere nke abụọ na nkeji 18. Ugbua, emeriela Sheffield n'asọmpị isi n'ime asatọ n'iko FA, enwebeghị goolu ọbụla Sheffield nyere na asọmpị nke anagbaghị na bee ha. Na Twitter, Fede Fernandez na ekpupụrụ Swansea okpu. End of Twitter post, 1 Tottenham na Rochdale bụ otu abụọ ga-eso Sheffield sụ mpị na otu egwuregwu bọọlụ asatọ ga a nọ na okara ịkpeazụ. Onyenkwuzi Swansea bụ Carlos Carvalhal kwuru na Jordan Ayew na Martin OIsson na-eso kwa na-ndị hụrụ na Swansea na-agbasị ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42834492,https://www.bbc.com/igbo/42834492,INEC: Ndebanye aha ntuliaka agaghị akwụsi n'ọnwa Jenuawarị 31,"Onye mgbasa ozi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ntụliaka na Legos bụ Femi Akinbiyi,kwuru nke a n' ozi mgbasa ozi nke ụlọ ọrụ INEC wepụtara na Legos.","ọtụtụ mmadụ na-atụ egwụ na ha nwere ike agaghị ebebanye aha ha Akinbiyi sịrị: ""Anyị na akwa ọha na eze na ndebanye aha ntuliaka ka na-aga n'ihu."" ""Dịka iwu ala ntunye aka ala anyị sịrị dị, aga akwusịlata ya ụbọchị irir isii tupu ntuli aka."" Ọ rịrọ ndị mmadụ ka ha bụta n'igwe debanye aha ha." afirika-55012477,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012477,Etu m siri mụta ịsụ asụsụ itoolu n'agbanyeghị na ahapụbeghị m Naịjirịa - nwata akwụkwọ UNN,Chisimdi bụ nwata akwụkwọ mahadum dị afọ 20 na-asụ asụsụ itoolu n'agbanyeghi na ahapụbeghi Naịjirịa.,"Ọ sị na njem ya na asụsụ malitere dịka mmadụ nyere ya ihe nkiri eji asụsụ Koria mee. Asụsụ Chisimdi na-asụ ugbua gunyere French, Jaman, Koria, Spanish, Igbo, Bekee na ndi ọzọ. Ọ sị na ya na-amụ etu e si asụ Yoruba ugbua. Gee akụko ya n'uju. Akụkọ a si n'aka Nnamdi Agbanelo na Chimezie UcheAgbo" afirika-45907295,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45907295,"""Ha achọghị ka m lụrụ nwunye m maka na a bụ m ohu""",Ndị obodo Ozalla dị na Nkanu n'Enugwu steeti agbaala mbọ mebie ihe nnanna ha mere.,Ha jịkọrọ aka mebie nkewa dị n'etiti ohu na amadi nke mere na ụfọdụ mmadụ anaghị enwe mmekọ. BBC Igbo gara hụ etu ha si mebie ya bụ ihe nakwa ndị ọ metụtara. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị 43861974,https://www.bbc.com/igbo/43861974,Saụt Koria agbanyụọla igwe mgbasaozi ga Nọt,"Dịka mkparịtaụka mba abụọ ahụ bụ nwanne ma bụrụ kwa ndị iro na-abịa nso, mba Saụt Koria agbanyụọla igwe mgbasa ozi echiche ha dị n' agbata ha na Nọt Koria.","Saut-Koria tinyeburu igwe mgasaozi echiche ha n'agbata ha na Nọt Koria Saụt Koria nwere ọtụtụ igwe mgbasa ozi n'agbata ha na Nọt Koria nke ha na-akpọ egwu ha na akụkọ na-akatọ Nọt Koria nke ndị agha Nọt Koria na ndị nkiti bi nso nwere ike ịnụ. A maghị ma Nọt Koria aga agbanyụ igwe mgbasa ozi nke ha. Ha na-akpọkwa akụkọ na-akatọ Saut Koria na ndi enyi ha. Dịka ozi ụlọọrụ ntakụkọYonhap kwuru na ọs i n' ngaalaba Mịnịstrị nchekwa ala ahụ, mba Saụt Koria mere nke a iji belata obiọkụ dị n'etiti ndị agha mba abụọ ahụ iji nye ohere maka ịkpa udo."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45812365,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812365,Igbu ichi: Ihe mere ndị Igbo ji egbu umunwoke apa n'ihu mgbe gboo,BBC gara emume ndi Umudioka mere n'Abuja iji mata ihe o ji bụrụ naanị ndị ji ihe na-egbu ichi na ala Igbo mgbe gboo.,"Odika Chidolue bụ naanị onye gburu ichi dịka e si eme ya mgbe gboo ka dị ndụ n'Umudioka putara n'ọgbọ n'emume a. Ọ gwara BBC na ya amatala ihe mgbe egburu ya ichi. N'otu aka ahụ, Nze Eyisi Ebuluo nke abụọ sị na ọ bụ mgbe nwafọ Umudioka ruru ihe dịka afọ isii ka mma nka (mma eji egbu ichi) ga-eru ya ihu. O kwukwara na onye ọbụla gburu ichi nwereike ị ga ebe ọbụla na-atụghị egwu ọbụla, maka onye ọbula hụru ya ga-ama na o bu oke mmadụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48589491,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48589491,Kelechi Iheanacho: Nna m achọbụghị iji ntị anụ na m na-agba bọọlụ,Kelechi Iheanacho na-agbara Naịjirịa bọọlụ akọwala ihe ọ gabigara n'aka nne na nna ya mgbe ọ na-amalite ịgba bọọlụ.,"Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo, Iheanacho sị na na mbụ, nna ya akadoghị ka ọ gbaa bọọlụ. Mana ugbu a, obi ụtọ na-eme nna ya n'ihi na ọ bụ onye ama ama n'egwuregwu bọọlụ. Ọ zarakwara ajụjụ banyere alụmnwaanyị ya. Kirizie ajụjụ ya ebe a." 42798055,https://www.bbc.com/igbo/42798055,E bula Metu nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi,"E bugala Olisa Metu, onye bụbu ode akwụkwọ gbasaozi ndị otu PDP na nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi, Anambara Steeti.","Metu abiaghị n'ụlọ ikpe dị n' Abuja na ụbọchị Jenuwari 22 E nwere egwu na ahụ ike nwa amadi ahu na-akawanye njọ mgbe aga ọsọ bute ya na nnukwu ụlọ ọgwụ,Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital (NAUTH),dị na Nnewi. Cheta na Metu onye na-azara ọnụ ya ihe gbasara mpụ n'ụlọ ikpe di n' Abuja abiaghị n'ụlọ ikpe ụbọchị ịrị abụọ na abụọ nke ọnwa Jenuwarị dịka okwesịrị n'ihi ejighị ahụ ike." afirika-48735748,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735748,AFCON fixtures: Ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara bụ uru Naijiria,Ala adịghị mma bu uru ndị nze.,"Otu egwu bọọlụ Guinea na Madagascar gbara 2-2 ụbọchị Satọdee Otu ahụ ka ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara n'asọmpi AFCON ụbọchị Satọdee siri bụrụ uru Naijiria. Ugbua, otu egwu Super Eagles bụzị ndị mbụ na 'Group B' dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị asata gbaa aka ahia mgbe ha zutere mba Burundi. Naijiria bụzị ndị nke mbụ na 'Group B' Guinea na Madagascar nyere onwe ha goolu abụọ abụọ na asọmpi ha nke pụtara na ha abụọ nwere naani otu akara otu akara ebe Naijiria nwere akara atọ. Ka ọ dị ugbua, ndị egwu bọọlu Naijiria ga-agafe n'agba nke abụọ ma ha merie Guinea ụbọchị Wenesdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun. Nkea bu nke mbu mba Madagascar nakawa Burundi na-esonye na asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON, mana ha egosila ụwa na elelịa nwa ite, onwekwara ike gbọnyụọ ọkụ. Akụkọ ga-amasị gị: Nollywood Language: Ka e si emepụta ihe nkiri Igbo" afirika-55865632,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55865632,Pregnancy: Ihe a gwaghị m maka idi ime m mechara hụ,Dịka mmadụ niile siri pụọ iche etu a ka ime ụmụ nwaanyị dị iche iche siri di.,Ụmụ nwanyị dị iche iche akọọwala etu ime ha siri pụọ iche ma ihe ha a na-atụghị anya mere ha. Gee ihe ha kwuru n'uju iji mụta ihe nwereike ịnyere gị maọbụ nwunye gị aka n'oge nke unu. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Vinning Ogu afirika-43412134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43412134,'Ndị ọchị ehi' Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau,"Akụkọ si Plateau Steetị apụta na-akọwa na ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gburu ndị agha Naịjirịa abụọ so na ""Operation Safe Haven"" (OPSH) mgbe ha na ndị nchekwa obodo nkịtị bara ọgụ n'obodo Dong dị n'ụsọ okpuru ọchịchị ime obodo Bassa na Jos Saụt dị na steeti ahụ.","Ndịagha Naịjirịa na ọrụ nchekwa na Plateau, Benue na Steeti ndi ọzọ Onye na ekwuchịtere OPSH bụ Majọ Umar Adams kwenyere na ndị agha nwụrụ, ma kwuo na ndị agha abụọ ọzọ merụrụ ahụ n'ọgụ ahụ. O kwukwara na ha nwụchịkọrọ mmadụ asaa maka ogbugbu mmadụ a. Majọ Adams na-akọwa na ọgụ a sitere n'ogbugbu mmadu 25 bu ndị Irigwe bu ihe a na-ebo ndi a na-eche na ha bu ndị Fulani na-achi ehi n'abali Monde. O kwukwara na ha wolitere aka maka nchekwa obodo ebe ọgbaghara a metụtara ịhụ na ogbugbu mmadụ a kwụsịrị. ""Ndị nchekwa obodo nkitị na ndi Fulani na-achi ehi nụru ọgụ n'ụtụtụ Wenesde na gbụrugbụru obodo Miango. Egbụrụ ndị agha abụọ ma merụọ abuọ ọzọ ahụ ka ogbaghara na-eme. ""Anyị nwuchịkọrọ mmadu asaa ma hazigharia ọru nchekwa n'ebe ihe a mere,"" Adams gwara ndị ntaakuko. Ndi ntaakụkọ kwụrụ na ndị nchekwa nkịtị 12 merụru ahụ n'ọgụ a ma nọkwara n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ ugbua. Ogbugbu mmadụ a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi bụzị ezigbote nsogbu na Naịjirịa bu ebe ọtụtụ mmadu na ekwu na gọọmentị Muhammadụ Buhari adịghị eme ihe kwesiri ka-ahu na ọgbaghara ndị kwụsiri. Mana, Buhari si na ya na-eme ike ya ka ahu na echekwara obodo niile nke ọma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47315594,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47315594,Nigeria Election 2019: Mụta etu ị ga-esi tụọ vootu ebe a,Nneka Eluogu bụ ọnụ na-ekwuchitere Inec n'Anambara steeti gwara BBC Igbo usoro ị ga-eso ụbọchị ntuliaka.,"Ọ kọwara etu ọ ga-abụ ị binye aka ị ghara imebi vootu ị tụrụ, bụ nke bekee kpọrọ 'invalid vote'. Akụkọ ga-amasị gị: Ọ kọwara etu ọ ga-abụ ị binye aka ị ghara imebi vootu ị tụrụ, bụ nke bekee kpọrọ 'invalid vote'." afirika-43195229,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43195229,Samsung Galaxy S9: Na-arụ karị anya mmadụ,Ụlọ ọrụ na-arụpụta ekwentị di icheiche a kpọrọ Samsung ekwuola na ekwentị ọhụrụ nke ụlọ ọrụ ha bụ Galaxy S9 na-arụ ọrụ karịa anya mmadụ.,Samsung arụpụtala ekwe ntị ọhụrụ Mana Samsung kwuru na ọ bụ n'ọnwa Maachị ka ekwentị ọhụrụ nke a ga-abata n'ahịa. Ekwentị ndị ohụrụ a ga-apụta na agwa dị icheiche. Ị ga-ejikwa tekịnụzụ a na-akpọ 'facial recognition' kpọghe maọbụ kpọchie kwa ekwentị gi. Ihe ọhụrụ Galaxy S9 nwere ike ị mee afirika-55849309,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55849309,Orlu Crisis: Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke,Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara?,BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. O kwukwara etu o si metụta akụnaụba obodo ha ugbua. Kedụ ihe ọ gwara ndị ọrụ nchekwa? Chọpụtakwa ya ebe a. afirika-55242238,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55242238,Amarachukwu Lilian Eze: Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu,Amarachukwu Lilian Eze bụ onye nwe 'Lilly Legends Sports Academy' sị na ọ bụ ahụhụ ọ tara mgbe ọ na-amalite ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere o ji hiwe ụlọakwụkwọ ebe a na-akuziri ụmụmaka egwuregwu.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Amarachukwu kọwara na nne na nna enyeghi ya nkwado ịgba bọọlụ, nke mere o ji raa ya ahụ na mmalite. Kama o mechara hapụ ebe ha gawa mba Afrịka ndị ọzọ dịka Senegaalụ na Equitorial Guinea bụ ebe ọ nọ gbata bọọlụ nke ọma. Ọ sị na o si ebe ahụ banye zie na mba Eshia tupu ọ laa ezumike nka ma lọghachizie Naịjirịa malite nkuzi egwuregwu. Ụdị egwuregwu ndị ọ na-akụzi gụnyere bọọlụ ụkwụ, ịgba karatị a na-akpọ Taekwondo, igwu mmiri dgz. Eze nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha kwado ụmụ ha n'ihe banyere egwuregwu ma ọ bụrụ ha nwee mmasị na ya. Kirie ihe o kwuru n'uju;" afirika-45854197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45854197,Peter Obi na ndị gọv Alaigbo: Ụmụ Igbo kwadoro ihe Atiku mere,"Dịka akụkọ pụtara na-egosi na obi adịghị ndị gọvanọ PDP n'ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ndu ha na mpaghara ahụ mma maka nhọrọ Atiku Abubakar họrọ Peter Obi dịka osote ya n'ịzọ ọkwa n'2019, ọtụtụ ụmụ afọ Igbo nakwa ndị Naijiria ndị ọzọ dọnyere Obi ukwu.","Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu uche gbasara ihe ndị Gọvanọ PDP n'Ala Igbo na-ekwu maka nhọpụta Atiku Abubakar họpụtara Peter Obi sị na ọ bụ uche aka ha, na ọ bụghị uche Ndigbo. Cheta na David Umahi bụ gọvanọ Ebonyi steeti mabụrụkwa onyeisioche 'South East Governors' Forum', kwuru na nhọrọ Atiku họpụta Peter Obi bụ 'imenye Ndigbọ ihere n'ihu' n'ihi na 'akpaghị ya akpa'. Ha nụrụ iyi na ha ga-agba ya mgba okpuru maka ịgbakụta nkwekọrịta ha nwere azụ. Otu onye a chọghị ka a kpọ aha ya nọ n'ọgbakọ ha mere gwara ụlọ ntaakụkọ Sun na mkpebi ha nwere bụ ka Atiku were onye chịbụrụ ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ bụ Charles Soludo. Onye ahụ sịrị, ""Udo karịrị ịdị ma ọ bụrụ na ọ họrọ Soludo nihi na ọ bụ ka anyị kwekọrịtara."" Kepukepu ọzọ na-eru BBC Igbo nti na-ekwu na-enwere ọtụtụ nọ na PDP ọwụwa anyanwụ anya ha dị n'ọkwa e nyere Peter Obi. Uche ọha Igbo Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu ndị gọvanọ PDP na-ekwu abụghị uche Ndigbo kama ọ bụ nke onwe n'ihi na obi dị Ndigbo mma na ihe Atiku mere. Onyeisi ndị ntorobịa otu Ohaneze bụ Mazi Okechukwu Isiguzo dụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ọdụ ka ha hapụ ịchụ mmasị onwe ha, chụwa ọdịmma Ndigbo. Otu ọkaiwu mabụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chima Nnaji tụnyere n'okwu ahụ oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara okwu Atiku na Peter Obi.""Ndị Igbo ekwesighi ị na-alụ ọgụ n'ime onwe ha"" bụ ihe Nnaji kwuru na ọ bụ ihe bu obodo a n'isi ya mere na ha kwesiri ịkwado onye nke ha iji nọchị anya ha n'ihe gbasara ọchịchị. O kwukwara na Ndigbo ghara iji aka ha ""kụwa efere Chineke nyere ha jiri rie nrị"" agbanyeghị ihe ọbụla Peter Obi mere ha bụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ. Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị Ndigbo na-egosi obi ụtọ nke ha kwupụtara na igwe okwu Facebook. Mubowale Kuforiji, Dozie Umekunie nakwa Nomso Muoka dere na Peter Obi bu onye kachasị mma n'ime ha niile. Ndị ozọ dịka Goddy Uwazurike nakwa Basil Olemerezi sokwa na ebumnuche ndị anyi kpọrọ na mbu. Pius Mordi dere na onweghị onye kwesiri ịge ntị n'ihe Umahi na ndị otu ya na-ekwu. 'Restructuring' ka mma karịa referadum Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48960705,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48960705,Aka uweojii akparala nwoke gbara nwa nwanne ya egbe n'Imo,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu sị na ha ejidela nwoke a na-ebo ebubo na ọ gbara nwa nwanne ya egbe hapụ ya n'ọnọdụ ọdụdụ ndụ ọnwụ ka mma.,"Maazị Ikeokwu sị na Enyinna Ibekwe di afọ 50 kpọọrọ nwa nwa nwanne ya bụ Chidinma Anyanwu pụọ. Ka ọ natara, ajụọ ya nwa ya na ya so pụọ o were sị ka Anyanwu soro ya gawa ịkpọlata nwa ahụ. ""Ka ha ruru n'ebe mmadu anọghị, Ibekwe gbara Anyanwu egbe n'obi wee rapụ ya ebe ahu dịka o che na ọnwụọla. Ikeokwu sị na Anyanwu kawara ahụ wee pụọ n'okporo ụzọ bụ ebe ndị mmadu hụrụ ya wee buru ya gawa ụlọ ọrụ ndị uweojii. Nwa ada a nọ ụlo ọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua dịka ndi uweojii siri kwuo. Ha sịkwa na ha ji Maazị Ibekwe ma na-eme nchọpụta etu mmiri siri banye n'ime akị oyibo. Ikeokwu si na ndi uweojii Imo na-etinye anya n'okwu dịka o si metụta igbu ọchụ na ntọri mmadụ. Akụkọ ọzọ metụtara uweojii Imo steeti: PPRO Imo Police Command: Anyị na-ele anya na ọ bụ ọgwụ ike gburu ha" afirika-44069810,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44069810,Bọjeetị Naịjirịa ọ ga-apụta n'ọnwa a?,"Mgbe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu Naịjirịa akwụkwọ eji hazie etu a ga-esi mee mkpata na mmefu (bụ nke Bekee kpọrọ ""budget"") nke afọ 2018 n'ụbọchị asaa nke ọnwa Nọvemba n'afọ gara aga ndị mmadụ chere na ha ga-ewepụta ya tupu a banye ọnwa Jenụwarị nke 2018.","Onyesisala Buhari nyere ndi omeiwu akwukwọ bọjeetị nke 2018 n'ọnwa Nọvemba nke afọ 2017 Ọnwa a nọ n'ime ya ugbua bụ Mee, bụ ọnwa nke ise na 2018, mana ndị omeiwu ewepụtabeghị ya bụ bọjeetị. Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba na-akọwa na etu o siri kwụrụ ugbua ga-eme ka ọ raa Naịjirịa ahụ, okachasị ebe ometụtara ọganihu obodo. Ihe mere ihe a jiri ka njọ bụ na amaghị mgbe ndị omeiwu ga-ebinye aka na ya bụ bọjeetị ma nye ya onyeisiala ka ọ mee ya iwu obodo. Ndị omeiwu sị na ihe mere ha ejibeghi wepụta 'bọjeetị 2018' a bụ maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ewetabeghị nkọwa etu ha sị chọọ ime mkpata na mmefu nke ha, n'agbanyeghị na akwụkwọ ndị omeiwu ji nwere nhazi etu ngalaba dị icheiche kwesịrị isi mee ego na 2018. Mana ngalaba na-ahụ maka nhazi, - nke a na-akpọ Ministry of National Planning n'asụsụ Bekee - kwuru na ihe niile ndị omeiwu kwesịọrị iji hazie bọjeetị dị n'ime akwụkwọ enyere ha. Ben Akabueze, bụ onyeisi ngalaba na-ahazi mkpata na mmefu kwuru na ihe niile ndi omeiwu chọrọ dị n'akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu n'ọnwa Nọvemba nke afọ gara aga. Mana, ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị omeiwu na-akpọ ndi isi ngalaba dị icheiche ka ha bịa zara ọnụ ha, nke bụ ihe ya ma na emeela. Ihe ọ pụtara Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba obodo na-ekwu na Naịjirịa agaghị ahazi akụnauba obodo ọfụma ma ya bụrụ na bọjeetị a apụtaghị. Na soshal midia di ka Twitter, ndi mmadụ na-ekwu maka ihe na-eme. Onye ji akara @AdeBanqie ede na Twitter dere na ndị Naịjirịa kwesiri ikwu na ndị omeiwu agaghị arụnwụ ọrụ n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Ụlọọrụ na-enyocha etu gọọmentị jiri agbari ""budget"" bụ BudgIT dere na ọ bu nke afọ a kachasi tee aka kemgbe ebidoro ihe banyere bọjeetị na Naịjirịa. @OduObodumu na-ajụ ma onwere obodo ọzọ akwụkwọ mkpata na mmefu notegoro aka ruo etu nke afọ a ruru. @Purrples sị na ya na-akpọ onyeisi ndị omeiwu ukwu ka ọ bịa zara ọnụ ya maka akwụkwọ mkpata na mmefu a. Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ @ApanpaOlasumbo bụ onye na-ajụ ihe mere ndị Naịjirịa ejighị ekwu okwu maka ihe a na-eme. Ka ihe ndị na-eme, ndị omeiwu na-ekwu na ha ga-ebinye aka na ya bụ akwukwọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa a, mana ọbụghị mbụ ha kwuru etu a, nke mere anyi ji ajụ, ""agbu ji agu ọ ga-arapụ ya ugbua?"". Akụkọ ga-amasị gị:" 42871594,https://www.bbc.com/igbo/42871594,Usain Bolt na-akuziri ndị otu Mamelodi Sundowns ka esi agbasi ọsọ ike,Onye ọgbaọsọ ama ama akpọrọ Usain bolt azụọla otu dị na Saut Afirịka akpọrọ Mamelodi Sundowns.,"Ndị Mamelodi Sundowns nabatara Usain Bolt ọfụma Ọ kuziri ha ka esi agbasị ọsọ ike. Bolt na ndị otu Sunsdown na ekekọrita otu ngalaba nkwado akpọrọ Puma. Ha abụọ bụcha ndị nmeri. Bolt si na ihe nkuzi ọsọ a ya na ndị Mamelodi Sunsdown gosiri na ahụ esichaghị ya ike. O kwukwara na oruo Jamaica, na ọ ga-gba mbọ gbatia ahụ ya ka ọ gbasie ike." 53378263,https://www.bbc.com/igbo/53378263,Chichi Igbo: A na-akọ m ọnụ maka na m nwere ahụ nwoke,Otu nwagbọghọ a na-akpọ Chichi Igbo kọwara ihe ọ na-agabiga n'elu ịntanet maka ụdị ahụ ọ kwara.,Ọ sị na ndị mmadụ na-akọ ya ọnụ maka na o nwere ahụ dịka nke nwoke. Nwada a gbaburu Naịjirịa bọọlụ sị na ma ọ bụghị udị obi o nwere na ọ gaarala anwụ site n'ọnụ a na-akọ ya. Kirie ihe o kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-50154445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50154445,Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke ?,Ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ahụ nwoke na nwaanyị ekwuola hoha na o nweghị mgbe nchọpụta sayensi ji kwuo na nwoke ịchado nwaanyị anya n'ara ga-adọtị ndụ ya.,"Otu onye n'ime ha aha ya bụ Pamela Udoka, BBC Igbo jụrụ maka ya bụ nchọpụta sị na ọ bụghị eziokwu n'ogo sayensi kwuru na onye ọbụla buputere nchọpụta ahụ mere ya ka aha ya wuo ewu. Mana onye ọzọ bụ Mmirimmasinachi Ekechukwu kwuru na ọbụrụ ma uche nke ya, ya bụ ihe nwekwara ike ịbụ eziokwu. Ekechukwu si na ụmụnwoke na-elelekarị ụmụnwaanyị mara mma na-eji agbatụ ọbara mgbalielu Lee ihe Ekechukwu kwuru: Lee ihe Pamela Udoka kwuru: Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-52040820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040820,Covid-19 n'otu nkeji: Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus?,Dịka akụkọ na-ewu na Chloroquine bụ ọgwụ dị ire maka ọgwụgwọ ọrịa Coronavirus.,"Mana n'aka nke ọzọ, enwebeghị ngalaba ọnụ na-eru n'okwu pụtara kwuo na ya bụ ọgwụ Chloroquine ga-agwọnwụ ọrịa Coronavirus. Ihe onyonyo a ga-agwa gị nke bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chukwunaeme Obiejesi, Jessica Nwankwo na Chimezie Ucheagbo" afirika-52653977,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52653977,Coronavirus update: Kedụ mgbe anyị ga-enweta ọgwụ coronavirus?,Kedụ mgbe anyị ga-enweta ọgwụ coronavirus?,Lee ihe ndị ọkammụta na-ekwu maka nke a: Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo afirika-51338294,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51338294,Coronavirus: O nweghi onye nwere ọrịa a na Legọs - Gọọmentị,Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ọbụghị eziokwu na e nwere onye na-arịa orịa corona virụs n'ụlọọgwụ ọbụla na steeti ahụ.,"Ha kwuru nke a n'ihi asịrị malitere ifesa na Twitter mgbe otu onye kwuru na o nwere onye a chọpụtara bu ya bụ ọrịa n'ụlọọgwụ dị na mpaghara Lekki. Akụkọ ahụ chọrọ ime ka egwu baa ọtụtụ ndị mmadụ n'ahụ. Mana Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike bụ Akin Abayomi gwara BBC Igbo na nke ahụ bụ akụkọ ụgha. Cheta na Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire ekwubuola na Naịjirịa dị njikere igbochi ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa. Ehanire kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'Abụja ụbọchị Fraịde iji kpaa ka a ga-esi gbochie arịa ọjọọ ahụ. Gọọmentị etiti asaala Amerịka Onyeisiala Muhammadu Buhari Gọọmentị etiti ehibela kọmiti ga-eleba anya n'ihe mere mba Amerịka ji kwuo na ha ga-akwụsị inye ndị Naịjirịa visa ịbata obodo ha biri. Ọ bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Mohammadu Buhari bụ Femi Adesina kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ ụbọchị Satọdee. Adesina kwuru na onyeisi kọmiti ahụ bụ mịnịsta na-ahụ maka nchekwa ime obodo bụ Rauf Aregbesola. O kwukwara na kọmiti ahụ na gọọmentị Amerịka nakwa ndị uweoji mba ụwa (Interpol) ga-arụkọ ọrụ iji hụ na e mezuru ihe niile mba Amerịka chọrọ iji wepu Naịjirịa n'akwụkwọ ọjọọ ha. Nke a na-eme dị ka onye jibu ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa Atiku Abubakar rịọrọ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ka obi ya dajụọ n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ. Atiku rịọrọ arịrịọ a n'ozi o zigaara Trump n'akara Twitter ya. Atiku Abubakar O kwuru na obi dị ya mwute maka atụmatụ ọhụrụ Trump wepụtara nke machiri inye ụmụ Naịjirịa akwụkwọ ikike ịbata mba Amerịka nke ha nwere ike iji tinye akwụkwọ ịnọgide na mba ahụ. Atiku rịọrọ Trump ka o cheta mmekọrịta Naịjirịa na mba Amerịka n'oge gara aga. O kwuru sị: ""Amerịka kweịrị iwepụta atụmatụ iji taa ndị ọchịchị Naịjirịa ahụhụ maka amaghị eme ha, ọbụghị ịta ụmụ Naịjirịa niile ahụhụ."" Atiku kwukwara na ụmụ Naịjirịa hụrụ Amerịka n'anya ma bụrụkwa ndị mbịarambịara kacha gụọ akwụkwọ na mba ahụ. Amerịka na Ọstrelia amachiela ndị njem si Chaịna Mba Rọshịa wepụtara ngalaba di iche ebe ndị njem si Chaịna alọta ga na-esi. N'ihi egwu maka Corona Virus, mba Amerịka na Ọstrelia amachiela ndị abụghị ndị be ha si mba Chaịna abata obodo ha. Mba ndị ọzọ machiri ndị njem si Chaịna bụ Japan, Pakịstan na Ịtali. Rọshịa wepụtara ngalaba di iche ebe ndị njem si Chaịna alọta ga na-esi. Mana otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kwuru na mmachi ahụ adịghị mma maka na o nwere ike ịmetụta ndị so arụ ọrụ iji gbochie ya bụ ọrịa ịgbasa ụwa niile. Liverpool buzi ezekwueche Alex Oxlade Chamberlain nyere goolu mbụ nke ndị Liverpool Ndị otu egwuregwu bọọlụ Liverpool ejirila ọkpụ goolu anọ asataghị asata wee merie ndị Southampton n'ehihie Satọde. Nke a pụtara na ha jizi akara 22 agafe ndị Manchester City bụ ndị na-esote ha na tebulu EPL. Onye ọbụla na-atụ anya na ọ bụ Liverpool ga-ebuli iko EPL nke afọ 2019/2020. N'egwuregwu ndị ọzọ, Chelsea na ndị Leicester City nyere onwe ha ọkpụ goolu abụọ abụọ. Everton gbara ndị Watford 3-2, ebe Bournemouth meriri Aston Villa 2-1. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lai Mohammed Ụmụ Naịjirịa kpụ mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed n'ọnụ maka ọ sị maghị ihe banyere iwu megidere Soshal Midia ndị ụlọomeiwu chọburu iwepụta na 2019. O kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ bụ Tim Sebastian na-agba ya ajụjụọnụ n'emume ihe nkiri a kpọrọ 'Conflict Zone' Mohammed sị na ọ nụtụbeghi maka iwu a ma jụọ 'Kedụ onye wepụtara iwu a'? Nke a mere aha ya (Lai Mohammed) ji na-ewi na soshal midia. Femi Fani-Kayode sị na Lai Mohammed tụrụ asị ọcha; Joe Mide kwuru na Lai Mohammed nwere obi ikwu ụdị okwu a; Cheta Sịnatọ Mohammed Sani Musa bụ onye kwadoro iwu a n'ụlọomeiwu n'ụbọchị ise ọnwa Nọvemba, 2019. Iwu a sị na a ga-ama onye ọbụla zipuru ozi ụgha na soshal midia ikpe ọnwụ bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ. Asụsụ Igbo abụrụla iwu n'Anambra Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Gọọmenti Anambra Steeti ekwusiela ike na asụsụ Igbo bụ asụsụ dị mkpa ụmụakwụkwọ niile ga-amụta na Steeti ahụ. Kọmishịọna agụmakwụkwọ bụ Kate Omenugha sị na amapụtara ụbọchị Wednezde ọbụla dịka ụbọchị omenala Igbo n'ụlọakwụkwọ niile. Amerịka na-amachiela ndị si Chaịna ịbịa be ha Mba Amerịka amachiela ndị mba ọzọ gara mba Chaịna na nso nso a ịbịta obodo iji kee nkwụcha maka ọrịa coronavirus. Ha sịkwara na ha ga-akpachikọ ụmụafọ mba ha si mba Chaịna lọta ruo izuụka abụọ maka inyocha ha ahụ. Nkeji ehihie Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ' Ihe Amerịka ji mechie inye Naịjirịa akwụkwọ njem Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump amachiela ndị Naịjirịa ịbata bịa biri e biri na mba ha n'iwu ọhụrụ o tinyere bụ nke ọ sị na ọ bụ maka nchekwa. Mba ndị ọzọ o metụtara gụnyere Eritrea, Myanmar, Kyrgyzstan ebe iwu a ga-amalite ọrụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Febụwarị 2020. Odeakwụkwọ ngalaba 'Homeland Security' bụ Chad Wolf sị na nke a bụ iji lebanye na nchekwa etu ndị mba ndị a ji ekerikọta ozi n'etiti ha. O kwuru na mba ndị a mara afọ n'ala n'ogogo ọnọdụ nchekwa mba Amerịka hiwere nye ha. Ọ sị na a gaghị ekwe ndị si mba ndị amachiri itinye akwụkwọ ikike ime njem bịa biri n'Amerịka a kpọrọ 'Permanent Visa' na Bekee. Wolf sị na iwu a agaghị emetụta ndị na-achọ ịbịa nlereanya, ndị azụmaahịa ma ọ bụ ndị bịara ịnara ọgwụgwụ maka ahụike. Ihedioha na-akụ aka na tipa bu aja Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti ekwuola na njem Emeka Ihedioha na aga ka ụlọikpe kachasị laghachị azụ n'ikpe ha kpere dịka mmadụ iti aka na tipa bu aja. O kwuru nke a n'Abuja dịka o zutechara onyeisiala Buhari na nke mbụ kamgbe o were ọchịchị dịka gọvanọ. Briten esila na European Union pụọ Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka United Kingdom esila n'ọgbakọ European Union pụọ n'ikpeazụ mgbe ha nọchara afọ iri anọ na asaa n'ime ya. O were United Kingdom ihe karịrị afọ atọ iji mee ntuliaka maka ọpụpụ ha. mana ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ bụ kedụzie ihe ọzọ ugbua ha pụrụ? N'egwuregwu Manchester United azụọla nwafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo site n'aka ndị Shanghai Shenhua na mbinye a kpọrọ Loan na bekee. Ighalo dị afọ iri atọ ga-agbara Man United bọọlụ site ugbua ruo ngwụcha oge asọmpi a nọ n'ime ya. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-56893983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56893983,Ndị ji egbe egbuola ndị uweojii ise n'Okigwe,Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo bụ Godson Orlando Ikeokwu kwuru na ndị uwejji ise nwụrụ dịka a na-achọ otu onye uweojii achọ dịka ndị ji egbe wakporo isi ụlọ ọrụ ndị uweojji n'Okigwe South.,"Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Maazị Ikeokwu sị na agaghị ụlọ ọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ. Nke na-abịa ka o mechara ụbọchị abụọ ndị ji egbe wakporo be aka na-achi Imo steeti bụ Hope Uzodinma n'Omuma ma mụnya mpaghara ya ọkụ. Ọ bụkwa otu ụbọchị ndi ji Ebe gbụrụ ndi uweojii, Kọstọm na ndị agha na mwakpo ha mere na Rịvas steeti. Ọ gụnyere na mwakpo a na-eme ndi ọrụ nchekwa aghara aghara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke buterela ogbugbu ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa nakwa ịgba ụlọ ọrụ ha ọkụ." afirika-43100223,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43100223,Anwụchiela onyeisi mahadum Zimbabwe maka asambodo Mugabe,"A nwụchiela Levi Nyagura bụ onyeisi University of Zimbabwe maka inye nwunye onye isiala Zimbabwe ochie, Robert Mugabe, asambodu edoghị anya.",A maghị ma a ga-anwuchị Grace Mugabe Ngalaba na-ebu agha megide mmerụaka anwụchiri Nyagura mana akpọbeghị ya ga ụlọikpe. E nyere Grace Mugabe asambodo mahadum n'afọ 2014 ka ọ gụrụ akwụkwọ nanị ọnwa ọle na ole agbanyeghị a na eji ọtụtụ afọ enweta ya. A gbasara edemede o dere ka ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kpọwa oku ka anapụ ya nzere ahụ. A mabeghị na-aga anwụchị Grace Mugabe. afirika-53864704,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53864704,NasirEl-Rufai: Gịnị na-esere gọvanọ Kaduna na otu NBA?,"Kemgbe abalị abụọ gara aga, otu jịkọrọ ndị ọkaiwu na Naijirịa bụ 'Nigerian Bar Assocation' (NBA) na aka na- achị Kaduna steeti bụ Nasiri El-Rufai na-eme tụmsara banyere oku ha kpọrọ El-Rufai ka ọ bịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha.","Nke bụ n'ihi na ndị isi otu ahụ wepụrụ aha El-Rufai n'ime ndị ga-ekwu okwu n'ọgbakọ NBA nke bụ nnukwu ọgbakọ ha na-enwe kwa afọ nke ga-abịa malite abalị 26 nke ọnwa Ọgọst ruo abalị 28 nke Ọgọstụ, afọ 2020. End of Twitter post, 1 Mkpebi ndị ndu NBA bịara ka ọtụtụ ndị otu ha horo ntutu ha taa sị na ọ bụrụ na ndị isi ha nye El-Rufai ohere ịbịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha, ha onwe ha ga-agbagha ya bụ ọgbakọ. Iwe ha bụ na ha na-ebo Gọvanọ El-Rufai ebubo ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrụ n'ihe gbasara ndị mmadụ a na-egbusị na 'Southern Kaduna'. Mkpebi ahụ rụrụ El-Rufai afọ nke mere o jiri saa NBA site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Muyiwa Adekeye sị na mkpebi ahụ kwadoro ukwu ""n'olu otu onye"", na ha enyeghị ikpemkwụmọtọ maọbụ ịnụrụ olu ọzọ tupu ha ekpebie ihe ha kpebiri. Ọ gara n'ihu kwuo sị ""n'agbanyeghị mwepụ ndị NBA wepụrụ m dịka onye ga-ekwu okwu n'ọgbakọ ha, o gbochighị m ị ga n'ịhụ itinye olu m n' ihe ga-ebute ọganihu Naijirịa"". Ndị Ọkaiwu ụfọdụ n'Ala Igbo gwara BBC na mkpebi otu ha dịka o kwesịrị. Onye bụbụ onyeisi ndị NBA n'Ebonyi steeti bụ Ọkaiwu Anthony Okah gwara BBC Igbo n'okwu ahụ na ""ọ bụghị ihe otu onye kwuru."" Okah kwuru na ọ bụ ndị ọkaiwu niile si na mpaghara Naijiria nakwa steeti niile nọ na NEC chịkọtara aka kwuo ya n'ihi na ""Gọvanọ Elrufai enwebeghị ihe mere iji gosi na ọ chọrọ ka a kwụsị ogbugbu mmadụ na Kaduna."" Ókaiwu Anthony Okah sị na mkpebi NBA a bụghị ""ihe otu onye kwuru."" N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ifeanyị Olumba sị na ""ọ bụ ihe e ji atụzị mmadụ aka ka ọ ga mee ihe dị mma, ka a kwụsị ịkwafu ọbara."" Olumba sị na o nweghị ka ya bụ ihe si gbasa agbụrụ maọbụ okpukperechi. Ọ kpọrọ oku ka El-Rufai ṅomiri aka chiburu Sokoto steeti bụ Shehu Mai Kangiwa, onye o kwuru katọrọ ụdị ogbugbu mmadụ na-eme na Kaduna oge o mere n'oge ọchịchị ya. Okaiwu Ifeanyi Olumba sị na Ụfọdụ n'ime ndị toro NBA were si na ọ bụ ụdị ihe bụ ihe a chọọ ka eme ndị n'ọkwa ọchịchị obodo na anaghị eme ihe ha kwesịrị ime. Ụfọdụ sonyere El-Rufai gbarụrụ ihu n' agwa ndị NBA kpasara ya. Ndị NBA nọ na Duste hụtara ya dịka ịkpa oke agbụụ na okpukpere ha kwuru na ha dọnyere El-Rufai ukwu. Mana ndị isi NBA si n' eziokwu adịghị n'ebubo ịkpa oke. N'akwụkwọ mgbasaozi nke onyeisi NBA bụ Paul Usoro binyere aka, o kwuru na mkpebi ahụ nke ndị ime obi otu NBA nwere dịka ha mechara nzụkọ n'abalị iri abụọ nke Ọgọstụ ""enweghị ka o si metụtụ agbụụ onye si maọbụ okpukperechi onye,""na ọ bụghị na ha na-ama El-Rufai ikpe ime ihe ọbụla."" Ya bụ okwu aghọọla ọgụ ịtụ okwute n'ime ahịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kpọwa oku ka e were aka e jiri soo El-Rufai were sooro ndị ọzọ NBA kpọrọ oku na ọgbakọ ha dịka Nyesom Wike. Ebe okwu si bido NBA hiwere ọgbakọ nke ga-abụ mbụ ha na-enwe ọgbakọ n'ikuku(virtual meeting)ma kpọọ ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu oku ịbịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha. Ndị ha kpọrọ oku gụnyere El-Rufai, onye ha chọrọ ka ọ bịa kwuo gbasara ọnọdụ nchekwa na steeti ya na ihe ndị ọzọ;Nyesom Wike maka inye onye abụghị onye Rivas ọkwa ọkaikpe ukwu na steeti ya na Peter Obi dịka onye mara etu e si ejikwa ego. Ndị ọzọ bụ Pastọ Tunde Bakare, ụkọchukwu a mara maka ịkpọ okwu aha; Oby Ezekwesili, onye so bido BringBackOurGirls,( ikwu maka atụmatụ Naijiria ọ na-ejikọ ka ọ na-ekewa Naijria), nakwa Salamatu Hussaini Suleiman bụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47789830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47789830,Anambra state: Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ,"Dịka a kwachara ozu Eze Christopher Nwabunnwanne Idigo nke Anọ bụ Eze Aguleri nwụrụ anwụ, e chiri Dr Michael Chinenye Idigo eze.","Mana ọchịchị ya na-apụta ụka dịka ndị ọ bụ ọrụ ha ịkpọpụta onye ga-abụ eze n'Aguleri kwuru na ọ bụghị onye ha họpụtara ka e chiri. Ha boro Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano ebubo na ọ manyere ndị Aguleri eze ọhụrụ ahụ n'olu. Mana ọnụ na-ekwuru Obiano bụ James Eze, kwuru na aka Gọvanọ adịghị na nhọpụta Eze Aguleri ọhụrụ. O kwuru na naanị ihe gọvanọ mere bụ inye ndị obodo họpụtara, asambodo njirimara. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46795966,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46795966,Akanu Ibiam International Airport: Arik akagbuola ifepụ n'ọdọugboelu Enugwu,"Ụkwụ tọrọ ndị njem ụgbọelụ chọrọ ịbanye Arik si ọdọụgbọelu Akanu Ibiam International Airport, Enugwu gawa ebe dị iche iche na Naijiria n'ụzọ taa bụ Tuzde n'ihi na a kagburu njem ha.",Ndị ọrụ Arik ndị mara ọkwa ịkagbu njem ụgbọelu ha ka ọ gachara awa atọ ụgbọelu ndị ahụ kwesịrị ifepụ kwuru na ọ bụ n'ihi na ihu eluigwe adịghị mma. Ha kwukwara na ha amaghị oge ihu eluigwe ga-agbake. Nkagbu ahụ hapụrụ ọtụtụ ndị njem n'ọnọdụ ṅgara-amara dịka ha na-eche ihe ha ga-eme onwe ha. Otu onye n'ime ha nyere aha ya dịka Nenye gwara BBC Igbo na ya na ụmụ ya anọ kwesịrị isi Enugwu gawa Abuja ebe ha ga-abanye ụgbọelu gawa ala Bekee n'uhuruchi ụbọchị Tuzde. Nenye kwara arịrị na ịkpọ ụmụ ya na ibu ha ga gbaa okporoụzọ gawa Abuja ga-enye ha nnukwu nsogbu. Ozi BBC nwetara na ụgbọelu Arik nke si Lagos gawa Enugwu n'ụtụtụ taa efetughị n'ihi otu nsogbu ahụ. Adịghị mma ihu eluigwe metụtakwara ụgbọelu ndị ọzọ. Airpeace gburu oge otu awa tupu ha efepụ n'ụtụtụ a. Ethiopian Airline gbukwara oge ma ha na-abanye ụgbọelu dịka ozi a na-apụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44586445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44586445,Ndi isi mba Afrịka abụọ ezerela ogbunigwe gbara na nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị,Ndị isiala mba Afịrịka abụọ zere ogbunigwe tata ka nzukọ ndọrọndọro ọchịchị Emmerson Mnangagwa gara yasara ka ogbunigwe gbara n'ebe ahụ ka aka nọ na-ekwu maka nke mere na isi obodo Etiopia bụ Addis Ababa ebe onyeisiala ha bụ Abiy Ahmed na ndi nkwado ya nọ na nzụkọ.,"The BBC's team at the rally captured the confused aftermath of the explosion Ihe nkiri si Bulawayo na egosiri na ogbunigwe gbara na ọgbo egwuregwu akpọrọ ""White City Stadium"" ka Mnangagwa na-akwado ịhapụ ka ọ gwachara ndị nkwado ya okwu. O merụhụ ahụ, mana osote onyeisiala Zimbabwe na ndi ọzọ ọkwa ha gbagotere n'ọchịchị Zimbabwe sọ na ndi merụrụ ahụ. N'Etiopia, akuko ọhụru na-erụ anya nti na-akọwa na otu onye nwụrụ site na ogbunigwe a gbara. Ndị ọrụ gọọmentị n'Itiopịa kwuru na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ka a tụrụ ogbunigwe ebe ndị na-akwado Abiy Ahmed, bụ onye ndọrọndọro ọchịchị, na-eme nzukọ. Ebe ogbunigwe a gbara, ka ọ ka mechara Ahmed kwuburu na ọtụtu mmadụ nwụrụ, ma kọwakwaa na ihe a mere bụ mkpamkpa apụtaghị ihe si n'aka ""ndị na-achọghị ka Itiopịa dịrị n'otu"". A kpọpụrụ Abiy ozugbo ogbunigwe a gbara. A na-eche na ogbunigwe siri n'ihe ndi Bekee kpọrọ ""grenade"" atụbara n'ime mmadụ puku na puku nọ n'ọgbọ Meskel nke dị n'isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa. Aka ikenga Ahmed bụ Fitsum Arega, sị na mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ihe a mere, ebe nke mmadụ isii n'ime ha dị ezigbo njọ. Abebaw Bekele, bụ onyeisi ndị otu gbatagbata Red Cross n'Addis Ababa, kwuru na ha ezipụla ụgbọala ""Ambulance"" 13 gawa ibute ndị ihe metụtara. Mmadụ puku kwa puku bịara nzukọ a Ha zigakwara ndị ọrụ gbatagbata 80 na ndị nọọsụ anọ. Bekele kwuru na ozi ya nwetara kwuru na mmadụ 100 merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara. Onyeisi oche ndị hazịrị nzụkọ a gwara BBC na anwụchịrị ndị mmadụ bu ogbunigwe n'ime akpa. Okwuru na ha nọ n'aka uweojii ugbua. O kwukwara na ha na-eche na enwereike nwe ebe ọru ndi nchekwa siri gba ọrụ. Na Zimbabwe, amabeghi mmadu ole merụru ahụ mana ndị ntaakụkọ na-akọwa na onwereike bụrụ na-etinyere ogbunigwe a n'okpuru ebe ndị nwere isi nọ. Akụkọ ga-amasị gị:" 50807055,https://www.bbc.com/igbo/50807055,2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akwapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife,"""Onye ajụrụ ajụ anaghị ajụ onwe ya.""","Nke a bụ otu n'ime okwu gbara ọkpụrụkpụ aka chiburu Anambra steeti bụ Chukwuemeka Ezeife gwara onye ntakụkọ BBC Igbo mgbe ọ gara ịgba ya ajụjụ ọnụ. O kwuru nke a iji dọọ aka na nti nye ndị ọnụ na-eru n'okwu Naịjiria na-ekwu na ọ bụrụ na enyeghị onye Igbo ọchịchị na ntuliaka na-abịanụ, ụtọ Naịjirịa na Igbo ebiela. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48319451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48319451,"Enugu Airport: A ga-ewepụ ""International"" na Akanu Ibiam Airport?","Maka Akun Ibiam Airport Enugwu ,","Gọọmentị Enugu steeti emechiela ahịa Orie Emene na ọdụanụ dịketere ọdọugboelu Akanu Ibiam International Airport dị n'Emena. Nke a mere ka Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) dọchara aka na ntị na ha nwere ike imechi ya bụ Ọdọugbọelụ maka ọnọdụ nchekwa ya. Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mbata na mfepụ ụgbọlelu Naịjirịa bụ Hadi Sirika ekwuola na gọọmenti etiti nwereike ịkwụsị mfepụ na mbata ụgbọelu si mba ofesi n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu. O kwuru na ọ bụ maka ihe ndị ekwesiri ịrụzi ebe ahụ ana-arụbeghị nwereike ibute ọdachị. Gọọmenti Enugwu steeti amapụtakwala ego a ga-eji bugherie Orie Emene. Ndi uweojii anwuchiela ndị omekome n'Anambra Ndị uweojii n'Anambra steeti adọọla ọhaneze aka na ntị maka enyị amaghị ama a na-emeta na facebook. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru nke a mgbe ha zọrọ ndụ otu nwoke ndị omekome tọọrọ n'Ogidi, okpuruọchịchị Idemili North. Minista Austria agbaala arụkwaghị m Heinz-Christian Strache Minista mba Austria N'ofesi e, Minista mba Austria bụ Heinz-Christian Strache agbaala arụkwaghị maka ebubo ngarị eboro ya. Ebubo ahụ kwuru na ahụrụ Strache ebe ya na onye mba Russia na ekwe ọnụ ihe ọ ga-akwụ ya ma ọ nyere ya aka merie ntuliaka na-abịanụ na abalị iri abụọ na isii nke onwe Mee a. Bayern Munich N'egwuruegwu ekpuwele Bayern Munich okpueze nke Bundusliga nke ugboro asaa taa mgbe ha ndị Eintracht Frankfurt kwakọrịtara mkpị n'agba nke ikeazụ ehihie Satọde. Bayern ji ọkpụ ise chara acha asatara otu were napụ Frankfurt ya bụ iko ma rọọ ya anya nkarị. Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Osinbajo ajaala Rochas Ike Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo akọọwala Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha dịka onye etu o si eme ihe na-agbagọjụ anya. O kwuru na ọ bụ makana ọ naghị eme nkpọtụ iji gosi iheọma omerela ndị Imo steeti kamgbe afọ asatọ ọ chịgoro steeti ahụ. O kwuru nke a mgbe ọ gara ịmepe ụfọdụ ihe ndị Rochas rụrụ ndị Imo steeti. N'ofesi, Mba Australia atụwala vootu ha taa bụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa May . Na mba ahụ ọ bụ iwu na ị ga-atụrịrị vootu .Ihe karịrị mmadụ nde iri na isii denyere aha n'akwụkwọ maka ịtụ vootu. N'egwuregwu, Agba nke ikpeazụ nke iko FA ga-adị kpọkpọ dịka Mancity ga-ezute Waford n'ama egwuregwu Wembley n'elekere ise nke mgbede taa. Mancity mabute iko nke a, ọ ga-eme ya iko atọ ha mabuterela n'izu egwuregwu a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Kidnapping in Nigeria: 'E gburu ndị atọrọ mụ na ha mana Chineke zọrọ m ndụ'" afirika-44646231,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44646231,"Chi ji ehihie jie ka mmadụ itoolu, ụgbọala 54 gbara ọkụ na Legos",Ozi si n'aka otu gbatagbata nke Legọs steeti nke a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ ekwuola na mmadụ itoolu nakwa ụgbọala 54 bụ ihe gbara ọkụ n'Otedola Roundabout dị n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan dịka ụgbọala bụ mmanụ ụgbọala gbara ọkụ.,"Lee ọkụ ọgbụgba si n'ụgbọala mmanụ mere n'Otedola Bridge na nsonso Berger, Legos taa Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ekwenti, onyeisi ndị na-achịkọta nchekwa njem ụgbọala nke a kpọrọ FRSC n'aha ịchafụ bụ Hyginus Omeje kọwara ihe butere ihe mberede ahụ bụ na ụgbọala ahụ bụ mmanụ kwụpụrụ n'aka onye kwọ ya ga kụrụ ogbe dị n'akwa Otedola nke mere ka ihe o bu daa n'otu ume ahụ kwafuo, ma nwuru ọkụ n'otu ntabi anya. "" Ihe mere oge ndị mmadụ iji ala ahịa maọbụ ọrụ nke mere nke bụ na e nwere ụgbọala kwụkọrọ ọnụ n'ahịrị mere na ụgbọala 54 gbara ọkụ."" Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gọọmentị dị iche iche dịka Lasema,Lasambus nakwa FRSC anọrọla ebe ahụ na-ebupụ ozu, ụgbọala ọgbụgbara ma na-enyere ndị merụrụ ahụ aka. Ngalaba na-ahụ maka nhazi ahịrị ụgbọala na Legọs steeti adụọla ndị njem ka ha hapu isi okporouzo gara Berger, Legos n'ihi nsogbu a dịka akụkọ na-ru anyị aka na-ekwụ na ihe mberede a akpọchiela ụzọ rue Third Mainland bridge. Lee ihe ndị nọ ebe ọ mere na-ekwu maka ya:" afirika-48048372,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48048372,World Malaria Day: Kedụ ihe bụ ịba na etu anyị ga-esi kwụsị ya?,Kedụ ka anyị ga-esi kwụsị ọrịa ịba?,"Malaria is spread by infected mosquitoes Ọrịa nke nwere ọgwụgwọ ka na na-egbu mmadụ rinne: Ọ na-egbu otu nwata nkeji abụọ ọbụla,ebe e nwere nsogbu ya nde 200 kwa afọ, dịka WHO siri kwuo. N'afọ 10 gara aga, ọgụ megide ọrịa ịba mịtara mkpụrụ, mana kemgbe afọ 2015, ndịiche dị n'ọganihu ahụ apụtachaghị ife : Ozi nchọpụta WHO wepụtara n'afọ 2018 na-egosi na onweghị ndịiche doro anya na na mbelata ndị ọrịa mere na afọ 2015 nakwa 2017. Oke ahụ ọkụ, onye ọmụma na isiọwụwa so n'ihe e ji ama onye na-arịa ịba Dịka abalị Eprelụ 25 bụ ụbọchị ncheta ọrịa ịba n'a mbaụwa, lee ihe ndị ọ dị mkpa ka ị mata: Njirimara ọrịa ịba Njirimara ịba - Oke ahụ ọkụ, isiọwụwa na oyi ọmụma - nke na-abịa ihe dịka abali 10 rue 15 anwụnta bụ ịba tara mmadụ. Nke a nwere ike jiri nwayọọ nke na agaghị ama na ọbụ ya , mana ọ bụrụ na eleghị ya anya awa iri abụọ na anọ, ịba nke Plasmodium falciparum na-ebute nwere ike ịkawanye njọ ghọọ nnukwụ ọrịa nwere ike dunye n'ọnwụ. Onye nwere ike ịrịa ya? Ụmụaka amụụ ebe ịba na-akpaịke nwere ike ibute ọria ahụ N'afọ 2017, ọkara mmadụ nọ n'ụwa nọ n'egwu ibute ọrịa ịba Ụmụaka erubeghị afọ ise bụ ndị kachasị nwe ike ibute ya. N'afọ 2017, ha dị pasent 61 nd(mmadụ 2666,000 ndị ịba gburu n'ụwa niile. Ndị ọzọ ịba na-awa agba bụ ụmụnwaanyị dị ime na ndị ahụ ha esichaghị ike. Kedụ mpaghara ịba ka akpa mkpamkpa? Ịba kachasị akpa ike n'Afrịka Dịka WHO siri kwuo, ndị rịaala ịba nakwa ndị o gburula kacha na mpaghara Afrịka, mana ụfọdụ akụkụ ọwụwa anyanwụ Asia, Eastern Mediterranean, Western Pacific, n'Ọdịda Amerika sokwa na-ebe ọ na-emetụta. N'afọ 2017, mba ise ketara ọkara mmadụ ole rịara ịba n'ụwa niile: Naijiria (25%), DRC Congo (11%), Mozambique (5%), India (4%) na Uganda (4%). Ibusa ọrịa Anwụnta na-ebu ụdị nje Plasmodium anọ na-ebute; P. falciparum, P. malariae, P. ovale nakwa P. vivax ọtụtụ mgbe, ọ bụ anwụnta 'anopheles' nwaanyị na-ebufe nje ịba ma ọ ta mmadụ. E nwere ụdị anwụ 'anọpheles 400 nke 30 n'ime ha na-ebu nje ịba. Anwụnta ndị a na-ata n'mgbede rue n'ụzọ ụtụtụ. Anwụnta 'anopheles' na-eyi akwa n'akụkụ mmiri, nke na-aghọ ọbụbụ , o mecha ọghọ anwụnta; ọ bụ nwunye anwụnta na-achọ ọbara o jielekwa akwa ya. Mgbochi N'afọ 2017, ọkara ndị n'iile nọ n'egwu ibute ọrịa ịba bụ ndị enyere nchekwa akwa e ji echeta (nchọpụta WHO) WHO na-enye ndụmọdụ ka e chekwa ndị nwere ike ịnweta ọrịa ịba site n'ụsoro dị ire. Ụzọ nchekwa abụọ bụ - neetị e jiri ọgwụ anwụ were siji na ịgba ọnwụ anwụ(IRS). Ịrahụ n'okpuru neeti e ji ọgwụanwụ were sijie na-ebelata mmekọta mmadụ na anwụnta Ịgba ọnwụ anwụ bụ ịgba ọgwụ anwụ n'ime ụlọ nakwa gburugburu otu ugboro maọbụ ugboro abụọ n'afọ. E nwere ike igbochi ịba site na inye ndị njem,ụmụnwaanyị dị ime nakwa ụmụaka ọgwụ ịba. Nyocha nakwa ọgwụgwọ Nyocha nakwa ọgwụgwọ n'egbughị oge bụ ụzọ kacha mma iso ọrịa ịbaIme n A na-agwọ ịba agwọ- I nwere ike inweta mpụtara nyocha ịba n'nkeji 30 site na nyocha pụrụ iche(microscopy maọbụ rapid diagnostic test). Dịka WHO siri kwuo, ịchọcha nakwa ọgwụgwọ ịba na-egbochi ọnwụ ma na-ebelata ikesa ọrịa ahụ. Ọgwụ kachasị arụ ọrụ n'ịgwọ ịba nke plasmodium falciparum butere bụ ọgwụ atinyere artemisinin dị na ya a kpọọ 'artemisinin-based combination therapy' na bekee). Nsogbu Ọgwụ ịba nakwa ọgwụ anwụ arụzịghị ọrụ Ọ dị mkpa inyocha ọbara a mịtara maka ịba WHO dọọ aka na ntị na anwụnta 'Anopheles' naghị anabatazị ọgwụ na ọgwụanwụ- nke a na-ewghachi ọganihu e nwerela na ọgụ megiode ịba azụ. Egwụ na-atụ na ngwa na ụzọ e ji alụso ịba agha ugbua ga-anyụ ka ọkụ. Ozi sị na nchọpụta WHO maka bịba gosiri na ọgwụanwụ ise a ma ama anaghị arụzi ọrụ na mba 68 bido n'afọ 2010-2017. Nsogbu ọgwụ ịba arụghị ọrụ bụ nsogbu ka dị ire. WHO sị na ịgba mbọ hụ n'ọgwụ na-arụ ọrụ bụ ide ji mgbochi na imebila ọrịa ịba ma na-akpo oku ka anya dị n'ihe ndị a. Nke a bụ iji hụ na a chọpụtara nsogbu ọgwụ arụghị ọrụ ngwangwa ozigbo ozigbo." afirika-50547204,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50547204,Ụlọelu a rụrụ n'elu ụgbọala,Ọ na-amasị Onye Itiopia bụ Abinet Tadesse ị nọ n'ime ụgbọala ya.,"Ọ chọkwara ebe ọ ga-ebi. Ọ chọpụtara etu ọ ga-eji gbuo mkpa. Ọ rụrụ ụlọelu nwere mkpuru atọ n'elu ụgbọala a. Ya bu ihe na-ada ebube. Ndị mere akụko a bụ Yadeta Berhanu, Firaol Belay na Habtamu Tibebu. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45394209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45394209,Akụkọ kachasị mkpa: David Mark esonyela na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"David Mark bụbu onyeisi ụlọomeiwu Sineti na Naịjirịa apụtala ikwu na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2019. O mere nke a dịka o gotere akwụkwọ mbanye ya n'isi ụlọọrụ PDP n'Abuja n'ụbọchị Tuusde. Ọzọ, 'I tinye anya na mpụ kachasị mkpa' Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo asaala Atiku Abubakar maka okwu 'restructuring'. Ọ gwara Atiku na nhazi obodo agaghị ekpochapụ nsogbu ụbịam na Naịjirịa, na ihe ka mkpa bụ ibuso agha megide mpụ. Na mba ofesi, Onye rụburu n'isi ụlọọrụ mba Amerịka bụ Monica Lewinsky, eweela iwe pụọ n'ebe a na-enwe mkparịtaụka mgbe a jụrụ maka mmekọ ya na Bill Clinton n'oge gara aga. Lewinsky mere nke a dịka ya na onye ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka na mba Israel. N'egwuregwu, Aka na-achịkọta otu egwuregwu Manchester United bụ Jose Murionho ejirila obere ihe gbahapụ ụlọ mkpọrọ na mba spain n'ihi akwụghị ụtụ isi. Akụkọ kwuru na o kwetara ịkwụ nha ruru nde dọlla abụọ n'ọma. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile China ga-enye Naịjirịa ego China ekwela nkwa inye Naịjirịa nakwa ụfọdụ mba Afrịka ndị ọzọ, ijeri dọla iri isii nke ha ga-eji emeziputa ma mepee obodo. Onyeisiala ha bụ Xi Jinping kwuputere nke a n'ọgbakọ 'Forum on China-Africa Cooperation' nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ na ya ugbua. Buhari na nhazigharị iwu ntuliaka Onyeisiala Muhammadu Buhari ekweghi ebinye aka n'akwụkwọ ga-agbanwe iwu na-ekpuchite ntuliaka. Nke a ga-eme ya ugboro atọ o na-ekweghi eme ka nhazigharị a ndị omeiwu mere bụrụ iwu. Mana o kwuru na ihe kpatara o ji mee nke ugbua bụ makana ọ dịbeghi etu o kwesịrị. Egela Ipob ntị Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa gwara ndị bi na mpaghara ahụ ka ha ghara ige otu chọrọ ka e kewaa Naịjirịa bụ Ipob ntị. Ụzọ Faulks dị n'Aba mgbe e mere ncheta Biafra Kọmishọna ndị uweojii n'Anambara bụ Garba Umar kwuru na Ipob bụ otu iwu machiri, nke mere na ha enweghi ikike inye onye ọbụla iwu. N'egwuregwu Tajudeen Agunbiade bụ nwaafọ Naịjirịa nwetara ihe nrite ọlaọcha n'asọmpi ndị nwere ọrụsị na-apịa tenis e mere na mba China. N'ime ndị Naịjirịa anọ gara asọmpi a, naanị Agunbiade ruru agba ngwụcha, nke mere ka o tozuo isonye n'asọmpi nke mbaụwa a ga-eme na mba Slovenia n'Ọktoba. Gere nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri ga-amasị gị taa 'Restructuring' ka mma karịa referadum" afirika-44217954,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44217954,Gọọmentị etiti akatọọla JOHESU maka mfanyeaka n'ụkwụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Gọọmentị etiti akatọọla ndị mfanyeaka n'ụkwụ ndị JOHESU Gọọmentị etiti akatọọla akwụkwọ ozi otu na-ahụ maka ndị nwe obirinajịọcha degara ya maka nfanyeaka n'ụkwụ Mịnịsta ahụike bụ Isaac Adewole kwuru na otu a kwesiri ịkwụsị ike n'ụzọ ime udo na bụghị ịkpa oke. Ndị ụka Katọlik na Naịjirịa emeela ngagharị iwe taa Ndị ụka Katọlik na Naịjirịa emezuola ọkwa ha maara nụ nke ndị Bịshọp ụka ahụ n'izuụka gara aga kwuru na ha ga-eme ngagharị iwe taa na Naịjirịa niile. Ngagharịnke a bụ maka ndị ụka ha egwuru na Benue Steeti. Trump na Moon na-akwado mkparịta ụka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Moon jae-in na-akwado enwe mkparịta ụka maka ihe mgbakwoji anya dị n'ụka ha na ndị Nọt Korịa. Cheta na Nọt Korịa kwuru na ha nwereike igbahapụ mkparịta ụka ya na mba Amerịka. Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze N'egwuregwu Onye nchịkọta otu manchester City n'oge gara aga bụ manuel Pellegrini ewerela ọkwa dịka ichịkọta West Ham United Ndidi, Iheanacho,Omeruo, Eze na ndị ọzọ awụchiela na Akwa Ibom maka njikere asọmpi Iko mba ụwa na ndị ọzọ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Bobmanuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa" afirika-43787359,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43787359,Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị na aka Yunịated Kindom dị n'asị akpọrọ ndị na-enwe mmorịkọta nwoke na ibe ya nakwa nke nwaanyị na ibe ya. Cheta na mba Naịjirịa na Yuganda so na ndị nyere iwu megide ụdị mmekọrịta ahụ, agbanyeghị ọgụ a na-alụ ịkwụsị ya. Ndị omeiwu Sineti akpọọla ndị Mịnịsta oku Ndị Sịnetị agwala Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun na Onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele ka ha wụchie n'ihu ha. Oku a bụ maka ego dị nde dọla narị anọ iri isii na abụọ ha jiri zụo ụgboelu Helikọpta nke ndị Sịneti na-akwadoghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:O Onyeisiala Buhari enyela ọkaiwu Keyamu ọrụ ọhụrụ Onyeisiala Mohammdu Buhari akpọpụtala Onye ọkaiwu bụ Festus Keyamo(SAN) dịka onye na-echute ọnụ ya n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Keyamo n'akara tuwita ya dere na ọ ga-enye nzaghachị maka nke a n'oge dị n'ihu. N'egwuregwu Eriela onye na-agbara Chelsea bọọlụ ebe azụ Marcos Alonso iwu maka ịme ihe ike megide Shane Long nke Southampton Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Ingland bụ FA kwuru na ọ gaghị agba asọmpi ha nwere n'ụbọchị ụka na-abịa abịa. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Chibuike Josh Alfred a na-akpọ Josh2Funny bụ onye ọkpaọchị kọwara etu o jiri bido ịkpa ọchị. 'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny" afirika-53746430,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53746430,Kamala Harris: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị onye isi oji a bụ osote Joe Biden ọhụrụ,"Joe Biden, onye na-azọ ọkwa ọchịchị mba Amerịka n'otu Demokrat ahọrọla Kamala Harris, onye ọkaiwu ka onye osote ya.","Ka a na-akwado ịga tụọ aka, n'afọ 2020 n'Amerịka, Joe Biden egosila ụwa niile osote ya na ntulaka na-abịa. Ọ bụ nwaanyị isiojii a na-akpọ Kamala Harris. Ndị mmadụ na-aja maka ị họro nwaanyị nke mbụ ma bụrụkwa onyeisi o Lee ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma maka ya:" afirika-48178358,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48178358,Meghan Markle Baby: Ọ bụ nwa nwoke!,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Meghan Markle abụrụla nne dịka ọ nwụrụ nwa nwoke.,"Ọ mụrụ nwa ya n'ehihie ụbọchị Monde bụ 6 nke ọnwa Mee. Ọkparaeze Harry gosiri obi aṅụrị ya site n'ozi ọ gbasara n'akara Instagram ya: End of Instagram post, 1 Ihe ị maghị maka ọkparaeze ọhụrụ a mụrụ: ""Obi dị anyị aṅụrị, ihe a bụ ihe ịtụ anya m hụrụ na ndụ m"" ka Ọkparaeze Harry gwara BBC. O kwukwara na ọ ga-agbasa ozi ọzọ n'ụbochị abụọ na-abịa ka mmadụ niile nwee ohere hụ nwa ọhụrụ ahụ." afirika-51798826,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51798826,Oil Prices: Ka ego mmanụ agbidi nwere ike ị si nyụọ Naijirịa anya,Enweela ọtụtụ nzụkọ maka mwakpo ọrịa Coronavirụs. kama nke mba ụwa niile kacha kpụrụ n'ọnụ bụ ndapụta nzụko mba ndị na-amịpụta ma na-ere mmanụ agbidi bụ OPEC (Organisation of the Petroleum Exporting Countries) mere n'ụbọchi isii nke ọnwa march afọ 2020 n'obodo Viena dị na mba Austria.,"Mmanụ agbịdị Naijiria na-egwupụta gbagoro kemgbe ndị agha nnupụisi Naija-Delta belatara mkpamkpa ha na-akpa na mpaghara ahụ Nzụkọ a bụ ka ndị mba bụ ndị otu ngalaba a belata etu ha si emepụta mmanụ agbidi dịka mba Chaịna bụ ndị kacha azụta ya bụ mmanụ n'ụwa niile anaghi azụ zị ka ha si azụ. Ọ bụ mba Saudi Arabịa bu ya bụ okwu n'isi. Ha sị na nke a bụ ka mgbere mmanụ agbịdi baara mmadụ niile ụrụ. Kama mba Rụshịa jụrụ ị so na ya bụ atụmatụ nke mere ka enwee nghọtahi na ya bụ nzụkọ ndị otu OPEC. Dịka ọ dị ugbua, enweghịzị iwu jikọrọ mba ndị bụ otu OPEC nke bụzị na mmadụ niile ga-eme etu o siri sọ ha site ọnwa Aprelu. Na-emeghị eme, ọnụ ahịa mmanụ agbidi ""Brent"" ejirila pacentị iri abụo na itolu daa rụọ dọlla iri atọ na asaa na ọma ebe mmanụ agbidi nke ""West Texas Intermidiate"" (WTE) ejirila pacantị iri atọ na abụọ daa ruo dọla iri atọ na atọ na ọma. N'agbanyeghị mkpa mkpa a bidoro ọhụrụ, Mba Saudi Arabia ekwuola na ha ga-ebido ịmepụta mmanụ agbidi karịa etu ha sị emepụta ya ugbua. Mbọ a niile bụ ka ha jiri aka ike mee ka mba Rụshịa kwenye na nkwekọrịta nzukọ ndị OPEC kwetara. Ụzọ ego mmanụ agbidi sị họrọ Naijirịa njọ ahịa Naijirịa na-akwado ibite $22.7B Atụmatụ mmefu ego (bọọjeti) gọọmentị Naijirịa mere maka afọ 2020 hibere isi na n'ọnụ ahịa mmanụ agbidi bụ dọlla iri ise na asaa. Nke a pụtara na ọ bụ ego sitere na ire mmanụ agbidi n'ọnụ $57 otu Barelụ ka Naijirịa ga-eji mezuo ihe ha tinyere na bujet. Mana dịka ọ dị ụgbụa ""agwọ nọ n'akịrịka"". Cheta na ọ bụ site na mmanụ agbịdị ka Naijirịa si eweta ego ha ji akwado mmefu gọọmentị dị iche iche. Ọ bụrụ na ego Naijirịa na-emefu akarịa ego ha na-akpata, ya bụ na ọtanisi nwere ike iwakpo ụmụ naijirịa. Kedu ihe njọ ahịa ego mmanụ agbidi nwere ike i butere Naijirịa? 1) Mbibi ego O nwere ike isiri Naijirịa ike ibite ego ụgbụ a n'ihi na ndị ga-ebinye ha ego ga-ajụ; ""kedu etu ị ga esi kwuo m ya?"". Ọ bụrụ kwanụ na nke a emeghị, gọọmentị na-akwado ibite ijeri dọlla iri abụọ na abụọ na ọma tupu ego mmanụ agbidi adaa. Mana dịka ego mmanụ agbidi kụrụ afọ n'ala ugbua, ego a a na-eti mkpu na ọ pere mpe nwere ike ọ gaghị ezuzi n'ihi ego echere na a ga-esi na mmanụ agbidi kwado bujet agaghị ezuzi. 2) Ụtụisi na mmefu G ọọmentị nwere ike i ji ụtụisi belata njọ ahịa ego mmanụ agbidi. Ọ bụrụ na ego mmanụ agbịdị gaa n'ihu na-akụ afọ n'ala, Naijirịa ga-achọ ụzọ ọzọ ha ga-eji nweta ego nke nwere ike ị bụ ibulite ụtụisi. Nke abụọ ga-abụ iwetulata aka na mmefu ihe ndị na ebulite ọnọdụ ndị mmadụ nke a kpọrọ ""Social Expenditure"". 3) Ụlọakụ Dịka n'afọ 2018 mgbe ọnụ ego mmanụ agbidi belatara, ụloakụ binyere ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbịdị banyere na gbaharịa. Nke a bụ maka na ndị ụlọọrụ ndị a enweghịzị ego ikwuchi ego ha bitere maka njọ ahia mmanu agbịdị. 4) Enweghị ọrụ Mgbe ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbidi na ụloakụ enweghịzi ego ha ji arụ ọrụ, ha na-achụkarị ndị ọrụ ha iji webileta mmefu ha. Ihe nke a pụtara bụ na otụtụ ndị mmadu agaghị enwe ọrụ. 5) Idozi obodo Nke a bụ na gọọmentị Naijirịa agaghịzị enwe ike itinye ego na-arụmarụ na ihe ndị dị iche iche eji edozi obodo. Nke a pụtara na ụloọrụ na arụpụta ihe na-eji ihe dịka ọkụ latrik na ezigbo okporo ụzụ arụ ọrụ ga anụ ụda ya. 6) Ndị na-achụ nta ego si ofesi Ọ bụrụ na obodo enweghị ihe arụmarụ di iche iche dịka Latrik na okporo ụzọ, ndị na-achụ nta ego si ofesi anaghị abiakarị obodo ndị a. Gịnị ka ndị ọkammụta maka akụnaụba na-ekwu Ọkammụta Michael Famoroti nke ụloorụ ""Stears Data"" kọwara na mmefu gọọmentị dị mkpa nke ukwu maka ịghazị akụnaụba obodo. Kama ọ sị na ọ na-atụ anya na mmefu gọọmentị n'afo 2020 ga-ebelata n'ihi na ego agaghị abata etu o si abata. O kwu kwara sị ""Goọmentị nwere ike ịmachi ọrire dọlaa dịka esiri mee n'afọ 2015"". Famoroti kọwara na dịka ọ bụ dọlaa ka mba na mba jị azụ ahịa, ọ bụrụ na Naijirịa ereghị mmanụ agbidi nweta dọlla, ya bụ na ha ga-amachị nke ha nwere. Ọ nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ hapụ ịtụ ụjọ ma ọ mefuo ego ha n'ụzọ ọbụla maka ụjọ. Dịka o si kọwaa na OPEC na mba ndị bụ ide n'ịzụ ahia mba na mba nwere ike iwepụta atụmatụ ga-akwụsị nghọtaghe dị na etiti ndị otu OPEC." afirika-44075806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44075806,Akụkọ kachasị n'abalị a: Rooney ọ ga-apụ Everton?,Akụkọ kachasị n'abalị a,"Ụlọahịa gọọmentị Anambra kwaturu Ndị na-arụ ọrụ na gọọmentị Anambra steeti nke kọmishọna na-ahụ maka njem bụ Uchenna Wiper du, kwatusiri ụlọ ahịa dị n'ụzọ Oby Okoli n'Awka taa. Ha sị na ọ na-egbochi ịgafe n'ụzọ sịrịrị werere. Ha chụpụkwara ndị ọgbatumtum nakwa ndị ọkwọ ụgbọala na-anọ nso ebe ahụ. Imam anwụọla Ụlọ ekpere ndị alakụba awakporo ma gbuo otu onye na Saụt Afrịka Onyeisi n'otu ụlọ alakụba anwụọla n'ụlọọgwụ na mba Saụt Afrịka. Ndị bu egbe na mma wakporo ha n'ụlọ ekpere ha n'obodo Durban, ma bewaa ya olu nke mere ka ọ nwụọ site na ahụ ọ merụrụ. Mmadụ abụọ ndị ọzọ merụkwara ahụ ka ndị ahụ wakporo ha mechara tụpụ ogbuniigwe eji mmanụ ụgbọala rụọ, nke munyere ọkụ n'ụlọ ahụ. N'akụkọ mba ofesi, Ndị agha Israel nọ na Golan Heights agbadola anya kamgbe abalị Tuusde Ndị mba Israel kwuru na ha wakporo ngwaagha ndị agha Iran dị n'ime mba Syria. Ndị Israel sị na ha mere nke a ije megwara ndị Iran gbapụrụ rọketị iri abụọ n'ebe ha nọ na Golan Heights n'abalị. Wayne Rooney ọ ga-apụ Everton? Wayne Rooney gbaara Manchester United bọọlụ afọ iri na atọ site n'afọ 2004 ruo 2017 tupu ọ gaa Everton bụ ebe o bidoro ịgba bọọlụ Onye egwu ndị England bụ Wayne Rooney nwere ike ịhapụ ndị otu Everton na ngwụcha afọ a. Akụkọ kwuru na Rooney si Manchester United gaghachị Everton n'afọ 2017, ga-ebido ịgbara ndị DC United nke dị na mba Amerịka bọọlụ n'afọ na-abịa. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkịrị taa Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa" afirika-46792009,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46792009,Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga,"Ndị otu ""Nigerian Labour Congress (NLC)"" ebidola ngagharịiwe taa n'ihi ụgwọ opekatampe ọhụrụ nke gọọmenti na-ekwebeghị ịkwụ ha.","Ngagharịiwe otu jikọtara ndị ọrụ maka ụgwọ ọnwa opekatampe dị puku naịra iri atọ N'afọ gara aga, otu gọọmentị hiwere maka inyocha ego ole a ga-akwụ ndị ọrụ wepụtara akwụkwọ ka gọọmentị kwụọ ndị ọrụ puku naịra iri atọ. Nke a bụ ihe kpaliri iwe ndị NLC, ha ji eme ngagharịiwe na steeti niile dị na Naịjirịa. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onyeisi ndị ọrụ n'Imo Steeti bụ Austin Chilakpu, o kwuru na ngagharịiwe a bụ iji gosipụta iwe ha banyere ọnọdụ ụgwọ ọnwa opekatampe. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ka ndị mmadụ nụrụ olu ha tupu ha amalite abụbọọrụ kama na mkpebi ahụ ga-esi n'aka ndị isi ha. Akụkọ ga-amasị gị" 45133768,https://www.bbc.com/igbo/45133768,Fr. Mbaka: O nweghị ụmị mmanụ maọbụ ego Buhari bunyere m na 2015,"N'ịsa ebubo ndị mmadụ na-ebọ ya na o nwere ihe e nyere ya iji kwado Buhari na 2015, Mbaka kwuputara n'oge ọ na-eme ọgbakọ 'Adoration' ụnyaahụ bụ Wenezde nke a na-akpọ""I no dey again"", na Buhari enyeghị ya ""oil well"" maọbụ ""ego ọbụla"".","Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 Cheta na tupu ntuliaka 2015, Mbaka buru amụma na Buhari ga-emeri na ntuliaka ahụ, nke mere na ụfọdụ na-atụ ya aka sị na o so dọnyere Buhari ukwu, dịka o mechara gaa zute Buhari n'Asọ Rock'. Ọ gwara ndị mmadụ ka ha hapụ ya aka n'ihi na amụma ọbụla si ya n'ọnụ pụta bụ ihe mmụọ nsọ gwara ya kwuo. Mbaka kwuru na agbanyeghị akụkọ ọbụla ma ọ bụ akaja ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ mee ya, na ọ ga na-ekwu eziokwu oge niile. Ọ gwara ụmụ Naijịrịa ka ha banye n'ekpere iji wepụ aka ekwensu n'obodo Naijiria. Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" Mbaka chetaara ndị mmadụ na dịka onye ụkọchukwu, na e chiri ya ihe atọ; ""onye ụkọchukwu"", ""onye Eze"" nakwa ""onye amụma."" Fr .Mbaka jikwa ohere ahụ were ekpere wee rịọ Chukwu ka ọ gbanwee ọnọdụ ndị egwuregwu bọọlụ Rangers ndị bịara ụka ịtụ mmamma n'ogige Adoration, Enugwu. O kwara arịrị na Rangers Enugwu gakatara ihu gawa azụ, ma rịọọ Chukwu ka ha bido inwekwa mmeri ọzọ." afirika-43944119,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43944119,Akụkọ kachasị n'abalị: Onye turu ogbunigwe be Nnia Nwodo?,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Onye turu ogbunigwe be Nwodo? Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Ka anyị bido n'Enugwu ebe e kwuru na a turu ogbunigwe na be onyeisi ndị ohanaze Ndigbo bụ Nnia Nwodo dị n'Ukehe taa. Ndị uweojii kwuru na ọdachi a mere n'ezie, ma mebie obere ihe mana amatabeghi ndị mere ya bụ ihe. Otu ndị ụka niile bụ CAN ebidola ngagharị iwe Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee na-eme ngagharị iwe taa maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na ọtụtụ ndị mmadụ e gburu na Benue steeti na steeti ndị ọzọ na mpaghara ugwu Awụsa. Cheta na CAN kwuru n'ụbọchị Fraide garaaga na ha ga-eme ngagharị iwe ahụ taa bụ ubọchị uka n'ụlọụka niile n'ala Naịjirịa. Ngagharị iwe a bu maka ndị ụkọchukwu abụọ na mmadụ iri na isi ndị ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe gbuo na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epureel. Dino Melaye bụ a kwaa akwụrụ Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu Nke a bụ maka na nkata ịkpọghachi ya site n'ụlọomeiwu sineti akpụọla afọ n'ala dịka e nwetaghị mmadụ ole iwu ntuliaka kwuru tinyere aka n'akwụkwọ ahụ. Melaye si n'akwa ya n'ụlọọgwụ kele ndị mpaghara Kogi-West ọ na-anọchite maka nke a. Onyeisiala Muhammadu Buhari awuchiela Washington DC Onyeisiala Muhammadu Buhari eruola Washiton dị n'Amerịka taa maka ọgbakọ ya na Donald Trump nwere echi. N'egwuregwu Man City gbara ndị West Ham ọkpụ anọ a satara otu n'asọmpi Premia Lig taa. Machester United gbakwara ndị Arsenal ọkpụ goolu abụọ a satara otu. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Nwaanyị meriri ọrịa kansa, lee etu o si mee ya. Onye meriri ọrịa kansa Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-52572018,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52572018,Igbo Musicians: Ndi Otiegwu Igbo kpọtụrụ akpọtụ na 90s rue afọ 2000,Ihe e jiri mara ndị otiegwu Igbo na ngwụcha 80s banye 90s bụ karịrị egwu ụka.,"Oge a bu oge ụka agba ọhụrụ pụtarachara ma dọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndị na-ekwu na ha echegharịala. Ụfọdụ n'ime ha nwere onyinye ịkụ egwu malitere ịkụ egwu ụka,ebe ndị enweghị nka egwu jụrụ egwu oringo na-achọzi egwu ụka. Egwu ụka bidoro gawa ahịa nke na ọ bụrụ na otiegwu Igbo esonyeghị, ụgbọ aghara ya. Alex O., Gozie Okeke, Theresa Onuorah na Charly Boy kpọtụrụ akpọtụ na 90s rue 2000 Mana ngwucha 90s na mbido 2000, egwu oringo dịka 'highlife' bilitere n'ọnwụ, ebe ụmụ agba ọhụrụ bidokwaziri kụwa 'hip-pop'. Lee ụfọdụ otiegwu Igbo wuru ewu na 90s na 2000 : 1. Helen Nkume Ọ bụrụ na a mụrụ gị maọbụ na i toro na 70s, 80s na 90s, ị gaghị echefu otiegwu ụka bụ Prophetess Helen Nkume. Egwu ya bụcha egwu ụka bụ ndị redio ji akwọ aka ụtụtụ, ebe ndị ọkwọụgbọala n'ala Igbo ji ya echere ndị ha na-ebu ọjị ụtụtụ. 'Nna biko' bụ egwu arịrị na mbeku Chineke wuru ewu na 90s. Mana Ị ma onye ndu otu egwu 'Galilee Gospel Band' nke ụka Cherubim na Seraphim na-akụbụ 'egwu ụwa'? Uchenna Ikonne kọwara na Helen Nkume onye bụbu Helen Williams na-akụbu egwu 'highlife' tupu ọ lụọ di ma zagharịa aha. Ụfọdụ egwu ndị o tiri 2. Gozie Okeke Ikekwa ị maghị aha ya, mana egwu ya na nwunye ya bụ ""Akachawa"" nke wuru ewu ngwụcha 90s na-atọpu gị isi. Ọ bụghị naanị gị ka 'Akanchawa' Gozie Okeke na-akpọfe, ọ na-amasị ndị Yoroba, ndị Ugwu, ọbụladị ndị ụka Alakụba n'agbanyeghị na e ji Igbo kụọ ya. Dịka otu onye ntaakụkọ ihe gbasara egwu doro anya bụ Ngozi Emedolibe kwuru na ndịiche dị na Gozie Okeke sị na ọ na-etinye okwu otutu n'ime egwu ya dịka, 'Jesus Otibimbodombo'. Gozie Okeke, onye Nnobi, Anambara steeti kụkwara ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere 'Nne m Ọma'. Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha Ọ zụlitere nwunye ya Njideka n'iti egwu tupu nwaada ahụ abanye ihe nkiri 'Nollywood.' Ụfọdụ egwu o tiri 3. Theresa Onuorah Theresa Onuorah bụ otiegwu a ma awa wuru ewu na 90s na agbanyeghị na otu egwu ya bụ n'ebe 1985 ka o bidoro ya. Ụmụagbọghọ na okoro toro n'ala Igbo na 90s aghaghị ịma egwu ya bụ Egwu Egedege nke a na-agba n'emume pụrụ iche dịka akwamozu, agbamakwụkwọ na mmemme ndị ọzọ n'ala Igbo nakwa ebe ọbụla ndị Igbo bi na mba na-eme emume na Naijiria. Onuorah, onye Unubi Anambara steeti bụ onye na-akwalite omenala Igbo site egwu Egedege bụ egwu ndị si na mpaghara ala Igbo ahụ na-agbakari. Ihe mere egwu Egedege nke Theresa Onuorah ji pụo iche bụ ọja a na-afụ na ya nke bụ ihe mbụ e ji ebido egwu ya niile; ejiji ya dịka ezenwaanyị, nzọ egwu ndị otu egwu ya ndị bụcha okoro na agbaghọ na-apụ anwụrụ. Theresa Onuorah na egwu Egedege ka dị ndụ mana ha naghị ewusi ugbua ka ọ dị na 90s. Ụfọdụ mmadụ ka na-akpọkwa otu egwu ya maka mmeruba ụbọchị mana ọ dịghịkwa ka ọ dị na mbụ oge e ji ịkpọ ya na mmemme ama ọgaranya ka ibe ya. Ụfọdụ egwu o tiri 4. Chika Okpala A kpọọ Chika Okpala, obi ọtụtụ mmadụ na-agbaga na ọkpaọchị a ma ama na ejije 'New Masquerade"" na-azakwa otu aha ahụ. Mana naanị ihe jịkọọ mmadụ abụọ bụ n ha bụ ndị Anambara steeti; Chika Okpala ọkpaọchi bụ onye Nnobi, ebe Chika Okpala nke na-eti egwu bụ onye Achina. Bro. Chika Okpala bụ ihe e jiri mara ya na ndị otu egwu ya ọ kpọrọ Believers Voice bụ ndị otiegwu ụka kpọtụrụ akpọtụ na ngwụcha 80s banye 90s. Ọ bụ otu n' ime ndị na-eti egwu ' a mụnworo ọzọ' , ndị ji onyinye Chukwu nyere ha na-agbaso ozi ọma, na abụghị iji kpata ego. Oreintal Brothers: Maka na m bụ onyeisi, ha chere na m na-eri ego nanị m - Kabaka Njirimara egwu ya bụ na ọ na-abụkarị egwu na okwu ntụgharị uche. Ọ na-ezi ozioma nchegharị ma na-ekwugidekwa ajọ ọchịchị obodo. Egwu ya kachasị wuo bụ ""Nigeria Ụkwụ Apụọ m Ọsọ"" mana o tikwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ụfọdu egwu o tiri 5. Charly Boy Charles Chukwuemeka Oputa, a ma dịka 'Charly Boy' bụ otiegwu a ma ama na Naijiria maka ị na-ekwupụ okwu gbasara ọganihu obodo, ikike dịrị onye na ndọrọndọrọ. Charly Boy bụ nwa nke abụọ nke ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị nwụrụ anwụ bụ Ọkaikpe Chukwudifu Oputa, onye Ugwuta n'Imo steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ na mba Amerịka mana ọ gbahapụrụ ya gawa iti egwu na ime ihe onyonyo(producer.) Egwu ya kachasị wuo ewu bụ nke ọ kpọrọ '1990' mana o tikwara egwu ndị ọzọ. Ọ bụ ya nwe ihe onyonyo 'Charly Boy Show' bụ obere ihe egwuregwu o ji aghọrị maọbụ maja mmadụ nakwa 'Zoom Time nke ya na Tunde Obe na-eme bụ ihe onyonyo ha ji atụnye ọnụ na ka obodo siri kwụrụ. Jụọ ndị na-achị gị ihe ha ji akụnaụba ọha mee - Charly Boy Dịka otu onye ntaakụkọ ihe gbasara ndị egwu doro anya bụ Ngozi Emedolibe si kọwa, "" Ụdị mmadụ Charly Boy na-ada ụda karịa egwu ọ na-eti ."" Emedolibe kọwara na Charly a kpọpụtala ọtụtụ ndị o mere ka ha chakee n'iti egwu na ọrụ ikpa obi ọma. Ụfọdụ egwu o tiri 6. Tyna Onwudiwe Tyna Onwudinwe bụ nwa afọ Igbo ọzọ a ma ama n'iti egwu wuru ewu na 90s. Ndị mụrụ ya bụ Maazị Justin Onwudiwe na Patricia Wilkinson, ndị Ugwuta, Imo steeti. Tyna Onwdiwe tiwere egwu oge ọ dị na nwata oge ọ na-eso ndị otiegwu nwere aha agụ egwu. Ndị dịka Tabansi Studio na Rogers Okonkwo' n'Ọka nakwa Ọnịcha. Egwu mbụ o tiri e ji mara ya 0bụ nke ọ kpọrọ, ""Afrikan Oyibo"" bụ nke o tipụtara n'afọ 1992. Mana nke kachasị wuo ewu bụ ya kachasị wuo ""Black On Black"" Ndị maa nwa ada a na-etu, 'Afrịkan Oyibo' ga-agwa gị na o so na ndị otiegwu Igbo hụrụ ụzọ oge ọtụtụ ndị isi ha na-apụ ọkụ ugbua ka nọ n'afọ nne ha. I zute Tyna n'ụzọ mbụ, ihe ga-aba gị anya bụ ụdị isi o bu n'isi nakwa uwe ya. Ọ na-akpụ akụkụ isi ya abụọ, ma kee etiti ya eke, ebe ọ na-ejikwa ejiji azụ-anụ-ụka. Tyna, dịka enyi ahụghị na-erịghị ya bụ Charly Boy bụ onye e ji ihe ndị ọzọ ọ na-eme matr karịa egwu ọ na-eti. Ọ na-eme ihe ejije Nollywood ma na-emepụta ndị otiegwu egwu nke Bekee kpọrọ 'producer'. Nke kacha nke bụ na ọ bụ onye na-ahazi akwa nke ọkọka Bekee kpọrọ 'fashion designer'. Ọ haziri Charles Oputa nakwa ejiji ya mee ka o site na onye na-eṅomi ejiji 'Michael Jackson, bụrụ Charly Boy, mmadụ nke onwe ya. Iji kọwaa ka ụtọ Tyna si dị ya n'obi, Charly Boy kwuburu na ọ bụ Tyna Onwudiiwe mere ya ihe ọ bụ taa, si na o si ala Igbo kpọgote ya Legos ma kwụọrọ ya ụgwọ ụlọ afọ abụọ oge ọ gbajuru dọrọ ya. Tyna hazikwara ọtụtụ ndị aha ha na-ada ụda.. na Naijiria oge ahụ. O mechara nwụọ ka ọ gbachaara afọ 47 n'afọ 2001 na Johannesburg dị na mba Saut-Afrịka ebe ka ọ nọ anara nleta n'ụlọọgwụ maka ọrịa kansa. Ọ hapụrụ ụmụ atọ were nwụọ. Ụfọdụ egwu o tiri 7. Alex O Alex Okoroigwe, onye a ma dịka 'Alex O' Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na ọ bụ nwa afọ Igbo mana o so na ndị bidoro egwu a na-akpọ 'hip-hop' na Naijiria, ebe ụfọdụ mara ya dịka onye Igbo buru ụzọ mewe egwu 'rap'. A ma ya dịka otiegwu Alex O, mana ezi aha ya bụ Alex Okoroigwe, nwa afọ Imo steeti. O wuru egwu na ngwụcha 80s banye 90s ọ kachasi oge o tipụtara egwu ya ọ kpọrọ, ""Celebrate'. Egwu a wuru ewu oge ọ bụla dị egwu ndị ọcha ka na-akọkarị na redio nakwa ebe a na-eme mmemme. Dika otu onye ntaakụkọ ihe gbasara egwu doro anya, bụ Ngozi Emedolibe si kwuo, ""Alex O bụ nwa afọ Igbo mbu tiri egwu 'rap' na Naijiria tupu ụmụ afọ ndị̀ ọzọ akụwa ụdị egwu ahụ."" Ọ lụrụ ,Oby Edozie, onye na-eme ejije n' afọ 2011, ha mụtara ụmụ abụọ. Alex O. lakpụrụ, aṅụghịkwa maka ya ọtụtụ afọ dịka akụkọ kwuru na ọ lara mba Saụtị Afrịka ga biri. O mechara lọghachị mana mbọ Alex O gbara ịlọghachi n' ịkụ egwu n'afọ 2015 a mitaghị mkpụrụ dịka ndị agba ọhụrụ wegharala ọgbọ. Ụfọdụ egwu o tiri Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44327247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44327247,Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere n'Abuja,"Ka ndị so n'otu pati All Progressives Congress (APC) nke ọwụwa anyanwụ na-agbakọ n'Abuja na atụmatụ ha kpọrọ ""South East Zonal Executive Committe"" na asụsụ Bekee, bụ nke ha si bụ iji hazie etu ha ga-eji mee ọgbakọ ukwuu nke pati ha, onye na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru na aka ya adịghi na ya.","Okorocha, dika ọ bụ sosọ ya bụ gọvanọ ndi APC nwere n'ala Igbo bụ onye a na-ahụ ka onyeisi APC n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya anọghị ya. Onye gbapere nzukọ a bụ osote onyeisi APC n'ala Igbo bụ Emma Eneuwku, bu onye kwuru na oge Igbo bụ ndị kewara ekewa agala. Ndị gara nzukọ a gunyere Ken Nnamani, Jim Nwobodo, Orji Kalu, Sullivan Chime, Martins Elechi, Ben Uwajimogu na ndị ọzọ. Ọnụ na-ekwụchịtere Ọkorocha bụ Sam Onwuemeodo kwuru: Ọbụrụ n'Okorocha nọ na nzụkọ ahu, mara na ọ bụ nke ziri ezi. Mana agaghi enwe nzụkọ ndị nwe APC na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma ya bụru na ya bụ onyeisi Pati n'ebe ahu anọghị ya. Nke a pụtara na ọ bụ oge ka ha na-egbụ."" Cheta na Okorocha na ufọdụ ndị APC na steeti ya na-enwe nsogbu maka ọ chọrọ ka ọgọ ya nwoke banye dị ka aka na-achi Imo steeti ma ya rituo. Ihe nkiri a na-egosi ihe onye okpa ọchị Uche Ogbuagu kwuru maka njem ya n'ọchịchị Rochas. Ihe Uche Ogbuagu huru mgbe ọrụọrụ na gọọmenti Imo Steeti" afirika-54151095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54151095,Ọgba Mbọ: Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya na m banyere n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ - Ifeoma Chidebe,Ifeoma Chidebe bụ nwaagbọghọ nwere mmasị n'ịrụ ọrụ aka kọwara etu o si banye n'ịrụ akpụkpọụkwụ karịa ịrụ ọrụ Bekee.,"Nwaada a kwuru etu ndị mmadụ si wee na-ajụ ya ma ""uche ya adịkwa ya"" dịka ọ gwara ha na ọ chọrọ ịga mụọ ya bụ akaọrụ. Ma kwuo etu o si gụchaa mahadum tupu ọ banye n'ọrụ a, ma kwuo na ọ bụ kemgbe ọ dị na nwata ka o jiri malite inwe mmasị maka ihe o ji aka ya rụpụta. Ọ kọwara na olileanya ya bụ ịgaru mba Itali bụ ebe a ma ama maka iji ezigbo akpụkpọanụ arụpụta akpụkpọụkwụ na ihe ndị ọzọ. O kwukwara na o nwere olileanya inwe nnukwu ebe nrụpụta ọrụ nke Bekee kpọrọ 'Factory' n'ọdịnihu. Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo" afirika-47275947,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47275947,Moghalu: Okwu inye Ndigbo ọkwa onyeisiala na 2023 bụ ajambele,Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu YPP bụ Kingsley Moghalu kwuru na nkwa na ọkwa onyeisisala ga-erute Ndigbo na 2023 bụ ajambele.,"Na mkparịtaụka ya na BBC igbo nwere, Moghalu kwuru na naanị na Ndigbo azọtara ya onwe ha. O kwukwara na nsogbu Ndigbo bụ adịghịnotu yana ha nwere 'muo ndị ohu,' na ahara ịgbara ndị agbuụrụ ndị ozọ odibo. N'okwu gbasara nhigharị ntuliaka, o kpọrọ oku ha Inec nye ohere ka ndị na-azọ ọkwa ọchịchị bidokwa achụmta vootu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52819559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52819559,"George Floyd: Ihe ọhụrụ ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya na Thomas Lane, J. Alexander Kueng",Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia na-ekwu uche gbasara ihe igwe eji ese foto otu onye n'ime ndị uweojii nwụchirị ya setere tupu ọ nwụọ.,"George Floyd gwara ndị uweojii ugboro ugboro na ya anaghị ekutezi ume Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na onyonyo ahụ gosiri na Floyd achọghị ndị uweojii ahụ okwu kama ndị uweojii niile so nwuchie ya so wee gbu ya bụ nwamadị. End of Twitter post, 1 @RealBrysonGray kwuru na agwaghị ndị mmadụ eziokwu gbasara ọnwụ George Floyd. @UsernameMcgee kwuru na ụfọdụ ihe ekwuru maka onyonyo ahụ e gosiri na-egosi ikpa oke agbụrụ. Oku ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ bụ ihe kpọtụrụ n'akwamozu ya Oku ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ bụ ihe rịrị ibe ya elu n'akwamozu George Floyd bụ onye ndị uweojii mba Amerịka pịgburu n'ihu ọha na nso nso a. Ndị bịara akwa ya tunyere ihe n'akwa ha nke na-ekwu, "" Anaghị m ekuli ume@ Ọtụtụ ndị kwuru n'ụlọụka na Houston, Texas ebe e mere ofufe nro maka ọkwụ ya chetara ""nwoke mpụ o mere bụ na ọ bụ onye isi ojii."" E buru ozu ya si n'ụlọụka gawa ebe a na-eli ozu a kpọrọ Houston Memorial Garden bụ ebe e liri ya n'akụkụ nne ya. Brooke Williams kwuru ka ịkpa oke agbụrụ kwụsị+++ Otu n'ime ṅwa nwanne Floyd bụ Brooke William kpọrọ oku ka agbanwee iwu ndị na-emegide ndị isi ojii. ""Iwu dị adị bụ nke e mere ji kwaada ndị isi ojii. E kwesiri ịgbanwe ya."" E tinyere ozu George Floyd n'ụgbọala bu ya gawa ebe e liri ya N'ozi nke onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ John Biden zitere n'ihe onyonyo o kwuru sị, ""ọ bụrụ na-enye George Floyd ikpemkwụmọtọ, oge ahụ ka anyị ga-ama n'anyị eruola n' ikpemkwụmọtọ nye agbụrụ ọbụla."" Mara na kemgbe e gburu ya n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee, ngagharịiwe a na-eme na mpaghara ụwa dị iche iche bụ nke ọnwụ ya kpalitere, ebibeghi. Ihe ndị 'Democrats' mere Democrats kneel in moment of silence for George Floyd Ndị ụlọomeiwu nta Amerịka nọ na pati Democrats buru ikpere n'ala taa dịka ha na-akwenyere George Floyd bụ onye ndị uweojii gburu ugwu nke ikpeazụ. Ha bikwasịrị ikpere n'ala ruo ihe dịka nkeji itoolu n'ime ụlọomeiwu mba Amerịka. Mgbe ha mechara nke a, ha kpuhere iwu ọhụrụ a kpọrọ 'sweeping legislation' bụ nke a ga-eji nwogharịa uweojii mba Amerịka. Iwu a na-abịa n'ime ọrụrụ izuụka a malitere ngagharịiwe n'obodo dị iche iche n'Amerịka maka mkpagbu ndị uweojii na ịkpa oke agbụrụ. Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd Ọ ga-adị mfe ikpe ndị uweojii ikpe ma kpaa agwa ọjọọ, gbochie ikpa oke agbụrụ nakwa kwụsị mkpagbu ndị uweojii a kpọrọ 'chokehold'. Ndị omeiwu na Minneapolis aṅụọla ikposasị ndị uweojii n'obodo ahụ. Ihe niile na-abịa dịka ọnwụ George Floyd ji bute atụmatụ mgbanwe iwu n'Amerịka. A mabeghi ma ndị pati Repuplican kachasị na Sịneti ọ ga-akwado iwu ọhụrụ a. Emume ofufe ncheta ọnwụ Ndị mmadụ gụnyere ndị ezinaụlọ George Floyd gbakọrọ taa bụ Tọzde maka emume ofufe iji cheta ọnwụ ya n'aka ndị uweojii n'abali iri abụọ na ise nke ọnwa Juun, afọ 2020. E ji abụ ụka nakwa ihe ọgụgụ si n'akwụkwọ nsọ na mmemme ahụ nke e mere na mahadum ""Minnesota University."" Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Andrew Elfrenbein nọrọ ebe ahụ kwupụta na ha na-ehiwe agụmakwụkwọ n'efu (scholarship) n'aha George Floyd. Onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Al Sharpton kwuru n'oge eruola ikwu, ""Wepụ ikpere gụ n'olu anyị."" Na nkọwa onye Floyd bụ ụmụ nne ya kwuru okwu kpọrọ ya ""mmadụ ọha, ""onye hụrụ ndị mmadụ n'anya"" na-enye ndị ọzọ aka site na inye ha nri maọbụ ndụmọdụ."" Ndị bịara emume ahụ nọrọ jii nkeji asatọ , ntabianya iri anọ na issi bụ oge onye uweojii ji ikpere pido akpịrị George Floyd n'ala tupu ya anwụọ. Emume ncheta ọnwụ Floyd onye a pịgburu na Minnepolis dị na steeti Minnesota bụ ihe a ga-eme ụbọchị isii dịka ozu ya ga-agazu steeti atọ tupu e lie ya n'ụbọchị nke isii. Ndị mmadụ ga-enwe ohere ịhụ ya nke ikpeazụ site n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ruo elekere otu nke ehihe na ""Cape Fear Conference B Headquaters"". Dịka ha sị kwubuo, a gaghị enwe ngagharịiwe oge a na-eme ofufe ncheta George Floyd. Second degree murder: A kpụpụla ndị uweojii atọ ndị ọzọ aka ha dị n'ọnwụ George Floyd Site n'akaekpe: Derek Chauvin, Tou Thao, J. Alexander Kueng na Thomas Lane Dịka a na-eme emume ofufe maka ncheta ọnwụ George Floyd, ndị okwu dị n'aka anwụchiela ma kpụpụkwa ndị uweojji atọ nọ mgbe onye otu ha pịgburu George Floyd na Mee 25,2020. George Floyd bụ onye isi ojii otu onye uweojii pigburu na mba Amerịka Monde abụọ gara aga oge ha na-achọ ịnwụchi ya maka ebubo iji $20 adigboroja achọ izu ihe. N'otu aka ahụ, a kwalitere mkpesa e wepụrụ ụlọikpe megide Derek Chauvin bụ onye uweojii ji ikpere pịgbuo Floyd ka ọ bụrụ nke Bekee kpọrọ 'second degree murder.' 'Second degree murder' bụ igbu mmadụ na akwadoghị ya akwado, na enweghị ihe doro anya ị ga-asị na onye ahụ mere gị. Ọ bụ ọkaiwu nke gọọmenti nke Minnesota bụ Keith Ellison gbara ama ụbọchị Wenezde oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka. Ọ bụrụ na e kpegbu Thomas Lane, Tou Thao na J. Alexander Kueng bụ ndị nọ n'ele ka Chauvin pịgburu Floyd, ha anọ na mkpesa, ọ ga-adọtara ha ihe ruru afọ 40 na mkpọrọ. Mana ihe ndị a niile akputughị iwe ndị mmadụ dịka ngagharịiwe barala abalị iri. Ọnwụ George Floyd butere ngagharịiwe megide ịkpa oke agbụrụ na ogbugbu ndị uwojii na-egbu ndị isi ojii Ngaghariiwe a bakwara mba ndị ọzọ dịka Briten, Naijiria na ebe ndị ọzọ. Ndị na-eme ngagharịiwe na Hyde Park dị na London na-eti ""Ndụ ndị isi ojii dị mkpa"", 'Anyị agaghị emechi ọnụ"" Donald Trump na ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya ga-ezipụ ndị agha ịkwụsị ngagharịwe emeela ihe karịrị otu izuụka maka ọnwụ nwoke isi ojii nke nwụrụ n'aka ndị uweojii. Trump sị na obodo na steeti akwụsịghị ngagharịiwe ahụ na ya ga- eziga ndị agha ka ha gaa""gboro ha ọgụ ahụ ngwangwa."" Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd bụ onye ndị uweojii pịgburu na Monde abụọ gara aga, na-akawanye njọ. N'ụbọchị Tuzde, ndị uweojii Las Vegas kwuru na a gbagburu otu onye otu ha ka ndị uweojii na-agbalị ịgbasa igwe mmadụ mgbakọrọ eme ngaghariwe. Ọtụtụ ndị mmadụ bụkwa ihe merụrụ ahụ dịka ndị ọrụ ji ikuku ose na aka ike achụsasị nsị mmadụ dịka ngaghariiwe ahụ gbasaalara rue obod mepere emepe iri asaa na ise.. N'abali Monde, mgbọ tụrụ ndị uweojii anọ dịka ngahariiwe na-akpọtụ na Louis dị na Missouri. Nnyọcha maka ọnwụ nke g ọọmentị mere gosiri na ọnwụ Floyd bụ mmadụ kpatara ya dịka o gosiri na o nwere 'obi nfepụ'(cardiac arrest) Onye uweojii pịgburu George Floyd ga-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka igbu ọchụ A nwụchiri Derek Chauvin n'ụbọchị Fraịde ka a chụchara ya na mmadụ atọ ndị ọzọ n'ọrụ maka ogbugbu George Floyd A nwụchiela onye uweojii pịgburu otu onye isi ojii a ma dịka George Floyd n'obodo Minneapolis dị na mba Amerịka, ma kpụpụ ya ụlọikpe ka ọ gaa zara ọnụ ya maka igbu ọchụ. Derek Chauvin bụ onye ihe onyonyo gosiri ka o sekpu ala ma tinye ikpere n'akpịrị Floyd, na ndị otu ya atọ, bụ ndị a chụrụ n'ọrụ ụbọchị Mọnde n'ihi ọnwụ Floyd. Ọnwụ Floyd butere ngagharịiwe na mwakpo nakwa ịgba ọkụ n'obodo ahụ, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụghị ọrụ e dinyere ndị uweojii ka ha na-arụzị, kama na ọ bụ ịkpa oke ka ọtụtụ n'ime ha na-eme megide ndị isi ojii. Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe gbara ogige ndị uweojii Minneapolis ọkụ Mike Freeman bụ onye ọkaiwu na Hennepin County kwuru na a ga-ekpe Chauvin ikpe maka igbu mmadụ na-echeghi ya eche, ma kwuo na a na-enyochakwu ndị uweojii ndị ọzọ nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere. Freeman kwuru na ọ na-atụ anya na a ga-akpụpụkwa ha ụlọikpe ka ha gaa zara ọnụ ha, mana o kwughizi ihe ọzọ gbasara ya. Ndị mmadụ nọ na soshal midia akpọgbuola onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump maka ịkpọ ndị na-eme ngaghariiwe maka ọnwụ George Floyd, agboro'. Trump kwuru n'akara Twitter ya na ya agaghị enye ohere ka ""ndị agboro"" metọọ aha Floyd dịka ya nyerela iwu ka ndịagha were ọnọdụ ịhụ na ha gbara onye ọbụla nwara izu ohi dịka ngagharịiwe na-aga n'ihu. Ozi Donald Trump wepụtara na Twitter maka ngagharaịiwe so ọnwụ George Floyd Ndị na-eme ngagharịiwe agbaala ogige ndị uweojii Minnepolis bụ mpaghara ebe ndị uweojii pịgburu otu nwoke isi ojii a kpọrọ George Floyd na mba Amerịka si. Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd Ha gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma mebikwa ụgbọala iji gosi iwe ha. Ọgbaghara dara nke abalị atọ dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na mba Amerika maka ọnwụ Floyd. Otu onye uweojii ji ikpere pịgbuo Floyd n'ụbọchị Monde oge ya na ndị otu ya na-achọ inwụchi ya maka ebubo iji ego adigboroja($20) chọọ ịzụ ihe. Ụlọnri a gbara ọkụ dịka ngagharịiwe na-eme na Minneapolis Ndị uweojii mba Amerịka chụrụ ndị otu ha mmadụ anọ ahụ n'ọrụ maka ọnwụ nwoke isi ojii gbara afọ iri anọ na isii bụ onye ndị otu ha pịgburu ka ha na-achọ ị nwụchi ya. Ọkụ gbara rue chi ofifo na nso ebe ndị uweojii nọrọ pịgbuo George Floyd Mana ezinaụlọ Floyd sị na nke ahụ ezughị, na ha chọrọ ka a kpụpụ ndị uweojii aka ha dị n'ọnwụ Floyd ụlọikpe. Ndị uweojii gbara ikuku anyammiri (tear gas) nakwa mgbọ rọba n'obodo Minneapolis dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe gbakọrọ na-eti mkpu ka a kpụpụ ndị uweojii ahụ ụlọikpe taa ha ahụhụ maka igbu onye nọ n'aka ha na-ejighị ngwaọgụ ọbụla. Ndị na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd E mekwara ngagharị iwe na Chicago, Illinois, Los Angeles, California, Memphis na Tennesse. Onye uweojii pidoro George Floyd akpịrị n'ala, pigbuo ya Ọtụtụ ndị mmadụ na mbaụwa nọ na soshal midia ji iwe ekwu maka ọnwụ Floyd bụ onye ndị uweojii pigburu na Minnesota dị n'Amerịka dịka ha chọrọ ịnwụchi ya. Nke a na-eme dịka ihe onyonyo gbara na sochal midia nke na-egosi ka otu onye uweojii ji ikpere pigide olu George Floyd n'ala, ya ana-asụ ude ma na-ekwu, 'Anaghị m ekutezi ume."" Ihe onyonyo nke onye nọ ebe ihe ahụ mere sere gosiri ka e jidere Floyd n'ala, ọ nọkata ya etie, ""e gbula m egbu."" Ndị nọ ebe ahụ nọ na-agwa onye uweojii ahụ ka o wepu ikpere n'akpịrị ya, dịka ha hụrụ na George anaghị emegharị ahụ. Otu onye n'ime ha sị, ""imi ya na-agba ọbara."" Onye ọzọ asị, hapụ akpịrị ya."" George Floyd gwara ndị uweojii ugboro ugboro na ya anaghị ekutezi ume Ulọọrụ nchekwa Federal Bureau of Investigation (FBI) kwuburu n'ụbọchị Mọnde na ha ga-enyocha ihe mere. Onyeisi ndị uweojii Minnesota bụ Medaria Arradondo sị na ndị otu ha mmadụ anọ ahụ ""abụghịzị ndị ọrụ anyị."" Ha kwuru na otu nwoke na-eche nche na ụlọnrị nwụrụ ka ya na ""ndị uweojii na-enwe mmekọrịta."" Mayor nke Mpaghara Minnesota bụ John Frey kwuru na ọchụchụ ndị uweojii anọ ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesi. Ọ sịrị na ihe mere bụ ihe jọgburu onwe ya. ""Ekwenyere m n'ihe m hụrụ. Ihe m hụrụ jọgburu onwe ya etu ọbụla isi tụlee ya. Na mmadụ bụ onyeisi ojii n'Amerịka ekwesighi ịbụ amamikpe ọnwụ."" 'Mberede nwa m egbuola m na ndụ' Nke a abụghị mbụ ndị uweojii mba Amerịka na-emekpa onye isi ojii ahụ. N'afọ gara aga, BBC Igbo wepụtara akụkọ nwa afọ Igbo nwụrụ n'aka ndị uweojii n'ụzọ na-agba anya mmiri. Chinedu Ikeobi na-agara onwe ya oge ndị uweojii chọro ijide ya, ya ajụ, ha were igwe latrik dọgbuo ya. 'Chinedu Okobi nwanne m na-agara onwe ya ndi uweojii Amerika gbuo ya' N'afọ 2014, ndị uweojii gburu onye isi ojii a kpọrọ Eric Garner ka ha na-achọ ịnwụchi ya na New York. Anyammiri na obi mgbawa ka ndị mmadụ n'ụwa gbagburugburu ji ekwu maka ọnwụ George Floyd n'aka ndị uweojii. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal midia: @aireyys si na ị mabeghị ka ọ na-adị ma ndị uweojii kwụsị gị. @Vidi_LaVida sị na anyammiri ka na-agba ya maka ihe onyonyo George Floyd ya kiriri. @db23bd si na- nke a bụ ọchụ, ọchị metụtara ịkpa oke agbụrụ. Kemgbe ya bụ ihe mere, ngagharịiwe bidoro na mpaghara dị icheiche maka ọnwụ George Floyd. Akụkọ ga-amasị gị:" 42956350,https://www.bbc.com/igbo/42956350,Onyeisiala Buhari amachiela mba ofesi ịnapụ ndị Naịjirịa ọrụ,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari amanyela iwu ga-egbochi ndị mba ofesi inwete ọrụ ọbụla na Naịjirịa ma ya bụrụ na o nwere onye Naịjirịa maọbu ụlọọrụ Naịjirịa so achọ ya bụ ọru na Naịjiria, ọkachasi maọbụrụ na ndị Naijirịa nwere ikike iji arụ ọrụ ahụ.","Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anọọla n'oche ọchịchị Naịjirịa afọ atọ Iwu a Buhari binyere aka so na ihe a na-akpọ Executive Order 5 n'asụsụ bekee. Ọ ga-enye aka hụ na ndị Naịjirịa nọ na mpaghara technụzụ ga-aracha elele kwesịrị iruru ha. Onye na-ekwuchitere Buhari bụ Garba Shehu sị na iwu a ga-eme ka Naịjirịa kwusie ike n'ihe gbasara ọganiru obodo. Iwu executive order a gbochikwara ndị mịnịstrị ndị nlekọta ụlọ inye ndị ọrụ si mba ofesi visa, maọbụrụ na ndị Naịjirịa ga-arụnwu ya. Kama ọ hapụrụ ohere ka otu ndị si mba ofesi nwee ike irụ ọrụ ma ọ bụrụ na onweghi ndị Naịjirịa nwere ikike iji arụ ya, mana ha ga-enwe atụmatụ tinyere ọganiiru ndị Naịjirịa n'uche, tupu enye ha ọrụ a. Buhari gwakwara ndị ministrị na ndị ngalaba na-ahụ maka sayensị na teknụzụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha tinyere ndị ọkachamara si Naịjirịa n'ime ọrụ ndị dị ka itụatụmatụ na ịwepụta ebumnuche projetị ndị ncheobodo." afirika-44928982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44928982,Oshiomole: Buhari ga-achụpụ Ngige,Onyeisi Pati APC bụ Adams Oshiomole eforola ntụtụ taa na ọ ga-achụpụ minista na-ahụ maka ọrụ na nrụpụta bụ Chris Ngige ma ọ bụrụ na o nupuisi n'okwu ya.,"Oshiomole gwara Ngige na minista ụgbọelu nke steeti bụ Hadi Sirika ka ha duo ndị otu ọchịchị nọ n'okpuru ministri ha n'iyi ọrụ n'ime otu izuụka ma ọ bụ ha hụ isi ya. Oshiomole n'akwụkwọ ozi oweputara n'oge gara aga kwuru na nnupuisi n'ime nke a megidere iwe otu APC nakwa ntuziaka onyeisiala Bụ Mohammadu Buhari. N'okwu ya ""ọ bụrụ na minista a jụụ, aga achụpụ ya n'ọkwa, anyị ga-alaghachi n'okpuru nrubeisi nke pati anyị, onweghi onye ọbụla karịrị pati anyị. Ọ bụ pati ahụ nyere ọkwa minista nyere ndị a ha jụrụ idu n'iyi ọrụ ọkwa, ọ bụ ihe ọjọ minista iji ikikere onwere na-enupuru pati ya isi. Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa ""O doro m anya na onyeisiala akwadoghi agwa ọ na-akpa iwepu aha ndị onyeisiala nyere ha"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44479226,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44479226,World Cup 2018: Ezi ebuola amụma na Super Eagles ga-eru ọkara ikpeazụ,Otu ezi akpọrọ Mystic Marcus ebuola amụma na Naịjirịa ga-eru agba ọkara ikpeazụ n'asọmpi Iko Mbaụwa ga-amalite taa na Rọshịa taa.,"Ezi (ọbụghị nke a) buru amụma na Donald Trump ga-achị mba Amerịka nakwa ọpụpụ Brexit ị di ire. Ezi a kpọkwara mba Ajentina, Beljọm na Uregua ga-eso Naịjirịa ruo ọkara ikpeazụ. Anụezi Mystic Marcus nke onye nwe ya bụ Juliette Stevens nwere akụkọ ibu amụma nkeọma. Anụezi a buru amụma na Donald Trump ga-achị mba Amerịka nakwa ọpụpụ Brexit ị di ire. O buru amụma a site n'ịkpụrụ mkpụrụ osisi ejiri ọkọlọtọ Naịjirịa, Ajentina, Beljọm na Uregua. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43792997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43792997,NCC: Telelogy ga-egosirịrị na ha ma ọrụ,"Ngalaba na-ahụ maka ikwu okwu n'igwe nke a kpọrọ Nigerian Communications Commission (NCC) na bekee, ekwuola na ịkwụ nde dọla $500 apụtaghị na Teleology Holdings, ụlọọrụ nwere isiọma ịbụ ndị ga-azụ 9mobile kama na ha ga-egosi na ha nwere nka ịrụ ọrụ etu a gaghị emegbu ndị mmadụ.","Teleology meriri Glo, Airtel na Alheri iji nweta ohere ịzụ 9mobile Osote onyeisi NCC bụ Umar Danbatta, gwara ndị ntakụkọ na Legọs ụbọchị Mọnde na naanị ma ha nyochaa ụlọọrụ nwetara ohere ịzụ 9mobile, ma hụ na ha ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọrụ ikwu okwu n'igwe ka a ga-enye ha ikike iweghara 9Mobile. Danbatta ekwughị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na nyocha ahụ gosi na Teleology amaghị ọrụ. Cheta na Teleology meriri ụlọọrụ ekwenti dịka Bharti Airtel, Globacom na Alheri nke Dangote nwere, iji nweta ikikere ịzụ 9Mobile. Teleology kwụrụ nde $500 bụ ego mbụ dịka ụlọọrụ nwere isiọma ịbụ ndị e nyere ikike izụ 9mobile. 9mobile nwere nsogbu kemgbe ụlọọrụ si Middle-East bụ Etisalat wepụrụ onwe ha n'ụlọọrụ ekwentị ahụ nke mere ka ha gụgharịa aha ha 9mobile. Akụkọ kwuru na Teleology si na Keystone Bank kwụọ nde $500, ebe United Capital Trustees Ltd na United Bank for Africa (UBA) Plc ga-erite uru na ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56387154,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56387154,Abigbo Mbaise: Egwu eji emevọ ndị mere ihe ọjọọ,"Abigbo Mbaise maọbụ ""Abụ Igbo"" bụ egwu eji mara ndị Mbaise.",Ndị so n'otu ahụ agwaala BBC Igbo uru egwu ahụ baara ndị be ha. Ha kọwakwara ihe a na-eme ndị mmadụ chọrọ ịso tupu ha abata. Gee ihe ndị ọzọ tụrụ n'anya ha kwuru n'ụjụ. Ndị mere ọrụ a bụ Vining Ogu na Chukwudi Okereke. afirika-45049555,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45049555,Sokoto: Ụgbọ okpukpu egbuola mmadụ 21,Otu ụgbọ mmiri njem ekpuola na mmiri Gandi dị na Sokoto bụ mpaghara ugwu nke Naịjirịa ma gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ na otu.,"Amatabeghi ihe butere mkpugharị ụgbọ mmiri ahụ mana nke a bụ ihe na-emekarị n'ihi oke ibu. BBC chọpụtara na ndị nọ n'ime ụgbọ mmiri ahụ bụ naanị ụmụnwaanyị dị iri na asaa na ụmụaka dị anọ. Ha si n'obodo Gandi na-aga obodo ha bụ Gandi-Kari mgbe ụgbọ mmiri obere ha ji kpuru na mmiri, ebe mmadụ iri gbanahụrụ ọnwụ. Ndị a nwụrụ bụ ndị na-alọta site n'ọsọ ndụ ha gbara maka ndị na-eyi ndụ egwu batara obodo ha n'ọnwa gara aga. Amatabeghi ihe butere mkpugharị ụgbọ mmiri ahụ mana nke a bụ ihe na-emekarị n'ihi oke ibu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46819765,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46819765,Justice Onnoghen: A ga-akpụpụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa Ụlọikpe?,Ozi ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka mkwupụta akụnaụba ndị no ọrụ ọha bụ nke akpọrọ Code of Conduct Tribunal (CCT) na Bekee bụ Ibraheem Al-Hassan binyere aka na-akọwa na aga akpụpụ Ọkaikpe Naịjirịa ụlọikpe n'ụbọchị Monde.,"Ozi ahụ kwuru na Ọkaikpe Onnogehn Nkanu Walter Samuel ga-aga zara ọnụ ya maka ekwupụtaghị akụnaụba. Ozi a kwuru na ọ bụ ngalaba Code of Conduct Bureau (CCB) tinyere akwụkwọ na CCT ka amalite ikpe Ọkaikpe Onnoghen ikpe. Iwu Naịjirịa hibere na onye ọbụla chọrọ ịrụrụ ọha ọrụ ga-ekwupute ma detuo akụnaụba ya niile. Ọ bụ na aka CCB ka a na-edetu ọnụọgụgụ akụnaụba mmadụ nwere. Ndị ga-etinye anya n'okwu a bụ ndị gụnyere Ọkaikpe Danladi Y. Umar. Dịka akwụkwọ ozi siri kwuo, ebubo isii dị n'akwụkwọ ebubo bu aha Okaikpe Onnoghen. Ọ bu n'afọ 2016 ka Ọkaikpe Ọnnoghen rigoro ọkwa dịka Ọkaikpe Naịjirịa, mana ọ bụ nA 2017 ka echere ya iyi ọrụ. Nke a ga-abụ mbụ a na-akpụpụ Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe. Ebubo bidoro dịka otu kpọrọ onwe ha Anti-Corruption and Research Based Data Initiative (ARDI) depụtara ozi si ka emee Onnoghen nyocha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53171978,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53171978,Coronavirus Recovery: 'Etu m si bute ọria Covid-19 ma merie ya',"Dịka ọtụtụ ka na-ekwu na ọrịa coronavirus adịghị na Naịjirịa, nwa afọ Igbo, Joseph Chidiebere, butere ya bụ ọrịa.","Ọ maghị ebe maọbụ etu o si bute ya n'ihi na o meghi njem ọbụla. O kwukwara na o cheghị na ya zutere onye ọbụla nwere ọrịa ahụ. Mana site na mbọ ọ gbara, na sitekwa n'ike Chukwu, ọrịa ahụ ataghị isi ya. Gere akụkọ ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Peter. Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-43051824,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43051824,Anwụchiela mmadụ atọ maka 'ozuzu ụmụaka' n'Imo steeti,"Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Chris Ezike, a gwala BBC Igbo na akụkọ ndị mmadụ na-akọ na-atọrọ ụfọdụ ụmụaka n'obodo Umuowa-Ibu dị n'Okigwe, bụ akụkọ ụgha.","Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa O kwuru na ọ bụ ozuzu ka ezuru ụmụaka ahụ na ọbụghị ntọ. Ọ sị na ndị otu ya anwụchiela mmadụ atọ gbasara ya bụ ozuzu ụmụaka a. N'agbanyeghị na akụkọ kọrọ na atọrọla ụmụaka ndị ahụ n'ọnwa Disemba gara aga, Ezike kwuru na-anwụchiri ha n'ime ọnwa Febụwarị a. Nke a na-abịa ka ụfọdụ ụmụnwaanyị obodo a mere ngagharịiwe iji gwa ndị uweojii megharịa ahụ chọta ụmụ ha atọ na-efu efu. Ndị ntaakụkọ kọrọ sị na ndị Umuowa-Ibu boro ndị uweojii ebubo nrụrụaka, sị na ha na-ana ha ego ma ha gaa ime mkpesa n'ụlọọrụ ha. Ezike kwuru sị n'iji gosi na onweghị nrụrụaka dị n'ebe ndị uweojii nọ dịka ndị ntaakụkọ si kwuo, na ụfọdụ ndị obodo Umuowa-Ibu bịara nleta otuobi n'ụlọọrụ ya Ụnyaahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44586002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44586002,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Lee onye nwere ike ịchị APC,Oshiomhole ọ ga-abụ onyeisi ọhụrụ otu APC?,"Tata ka otu pati na-achị Naịjirịa bụ APC ga-eme nzụko ukwu ha ga-eji ahọpụta onyeisi oche na ndị ndu ha N'ihu nhazi nzụkọ a, onye chịbụrụ Edo steeti bụ Adams Oshomole enwetara nkwado onyeisiala Buhari na onyeisi APC bụ Bola Tinibu ịbụ onyeisi oche. DSS ka nwuchiri Abaribe Onye omeiwu na-anọchịte anya Abịa Sawụtụ bụ Eyinnaya Abaribe na ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ka nọkwa na-aka ndị DSS. Onwebeghi ihe asị na ọ bụ maka ya ka eji ejide omeiwu a, mana ndị PDP, na ohaneze ndị Igbo si na nke a ekwesịghị ime na ọchichi onye kwuo uche ya. Gụọ akụko a n'uju ebe a. Okwu Trump na Kim na-aga ọfụma Na mba ofesi, Mba Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị emume nkwado agha ha na-eme na Sawụtụ Kọria. Ọnụ na-ekwuchitere mba Amerika n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ James Mattis kwuru na ha were mkpebi a maka nkwekọrịta Amerika na Nọt Koria nwere n'ụbọchị ole na ole garaaga. N'egwuregwu iko mbaụwa Ụmụ Naijiria ka na anwụrịkwa maka mmeri Ahmed Musa nyere ha ụnyaahụ Mana egwu ka dikwa taa, ka Beljịọm ga-ezute Tunishia, ebe Saụt Koria ga-ezute Mekziko. Nke ikpeazụ ga-abụ nke Jamini na Swidin n'elekere asaa nke abalị taa. Gee akụkọ anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke tata bụ nke nwoke na esi ofe onugbu ọfụma. Kerie ya ebe a: Ofe onugbu" 46546398,https://www.bbc.com/igbo/46546398,NPC ka na-ana ego asambodo nwa ọhụrụ,NPC ka na ana ego asambodo nwa ọhụ r ụ,"Ka ọ gachara ihe karịrị awa 24 ụlọomeiswwu nta machiri ya, ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ nke a kpọrọ 'National Population Commission' na bekee ka na-ana ego maka asambodo ọmụmụ nwa. Omeiwu Nkeiruka Onyejeocha onye kwulitere okwu a n'ụlọomewu kwuru na ịna ego maka asambodo ọmụmụ nwa na-eme ka ndị bi n'ime obodo hapụ idenye aha nwa ha n'akwụkwọ. A na ana ndị nwa ọhụrụ ha erubeghị ọnwa atọ narị Naira ise, ebe ndị karịrị nwere ike ịkwụ puku naira anọ. Gọọmentị Abịa azachiela Alex Otti John Okiyi Kọmishọna mgbasaozi, Abia Steeti Gọọmentị Abịa steeti azachiela Alex Otti bụ onye ji ọkọrọtọ APGA azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na okwu ya na ya ga-enyocha nrụrụaka mere n'oge ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu ma ya banye n'ọchịchị. Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ John Okiyi gwara Alex Otti na egwu nyocha anaghị atụ Ikpeazụ, kama Otti buru ụzọ nyocha ije ya na ndị chịrịla steeti ahụ oge gara aga. Sineti ekwenyele na South East Dev. Commission Bill Ụlọomeiwu ukwu etinyele aka nkwado n'akwụkwọ iwu maka imepe South East Development Commission bụ kọmishọn nke ga-ahụ maka mmepe na steeti ise dị n'Alaigbo. Enyinnaya Abaribe bụ otu n'ime ndị kwadoro ya bụ akwụkwọ na sineti sị na ya bụ kọmishọn ga-ehiche Igbo anya mmiri kemgbe agha. China ejidela onye Kanada ọzọ Michael Spavor (Akaegbe), Michael Koving bú ndí Kanada ndí Chaína ji Ka na-ekwu ka a na ekwu o, na mba China a kpọchiela onye Kanada ọzọ bụ onye China boro na o mebiri iwu nchekwa obodo ha. Michael Spavor bụ onyejiegoachụego e jidere ụbọchị Tọzde mere ya onye nke abụọ nọ na mkpọrọ na mba China bụ nke mere na mba abụọ a ejighị ezigbo anya ele onwe ha. Amachiela igosi mgbasaozi ịgba chachacha N'egwuruegwu, Na mba Briten a mechiela igosi mgbasaozi ịgba chachacha oge ana-egosi asọmpi egwuregwu bọọlụ. Ndị otu ụlọọrụ na-agba chacha kpọrọ onwe ha, 'Industry Group for Responsible Gambling' sị na nke a ga-ebido ị dị ire n'afọ 2019. Akụkọ ga-amasị gị Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri Kingsley na-akpa isi" afirika-52533136,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52533136,Ọgba Mbọ: 'Amalitere m ịrụpụta mkpuchi imi iji nyere ndị mmadụ aka' - Nwa Aba,Ikwani Ukoha Emmanuel bụ onye ụkọchukwu na-arụpụta mkpuchi imi.,"Ọ sị na oteela ya ọ hapụru ịkwa akwa mana dịka okwu coronavirus dara, o wee laghachị n'ọru iji nyere ndị mmadụ aka. Ikwani kọwara etu e si achọpụta akwa dị mma iji akwa mkpuchi imi nakwa etu o si arụpụta ya. Ndị mepụtara ya: Ikechukwu Kalu na Chiemela Peter." media-43943179,https://www.bbc.com/igbo/media-43943179,Otu jikotara ndị ụka bụ CAN ebidola ngaghari iwe ha taa,Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee na-eme ngagharị iwe taa maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na ọtụtụ ndị mmadụ e gburu na Benue steeti na steeti ndị ọzọ na mpaghara ugwu Awụsa.,"Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa Cheta na CAN kwuru n'ụbọchị Fraide garaaga na ha ga-eme ngagharị iwe ahụ taa bụ ubọchị uka n'ụlọụka niile n'ala Naịjirịa. Ngagharị iwe a bu maka ndị ụkọchukwu abụọ na mmadụ iri na isi ndị ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe gbuo na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epureel. Otu nwoke aha ya bụ Oluyemi Fasipe weputara ihe nkiri a na twitter gosi nghagharị iwe CAN mere n'Ondo steeti taa. O kwuru na ha mere ngagharị iwe a n'ihu ụlọọrụ gọvanọ steeti ahụ. Onye ọzọ aha yabụ Easy Akins weputara ihe nkiri nke ya gọsị ndị ụlọakwụkwọ so kwa na ngagharị iwe CAN taa. O kwuru na ogbugbu mmadụ a kwesịrị ịkwụsị kpam kpam. Mana ọtụtụ ụlọụka na Naịjirịa esonyeghị na ngagharị iwe nke taa dịka CAN siri kwu. Oge BBC Igbo kpọrọ onye ode akwụkwọ otu CAN aha ya bụ Musa Asaki maka ihe a, o kwuru na ọtụtụ ụlọụka esonyeghị na ngagharị iwe a maka na ekwughị maka ya bụ ngagharị iwe n'oge ya mere ọtụtụ. N'okwu ya: ""Anyị ga-eme ngagharị iwe ọzọ n'ụbọchị ụka n'abia. Anyị nwere olileanya na oge ahụ, ọtụtụ ụlọụka ga-eso anyị na ngagharị iwe anyị. Uru ọ dị na ngagharị iwe a Asaki kwuru na o nweghị ihe ọnye ọbụla nwere ike ịme n'oge ọchịchị gọọmentị a ga-adị iche maọbụ ga-amịta uru. ""Anyị na-eme nghagharị iwe a, makana sọọsọ ọlụ anyị bụ ike anyị ugbua. Ka chukwu nna mmere anyị ebere"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53197101,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53197101,"Dandruff, Scalp psoriasis, Ringworm na ihe ndị ọzọ na-eri ntutu gị","Ọtụtụ oge ka ị ga-ahụ ebe mmadụ na-akụ isi ya kpakam kpakam chee na ọ bụ inyi dị ya n'isi na-akọ ya ọkọ, mana ha amaghị na ọ bụghị naanị na ntutu ruru inyi mere ihe ji ata mmadụ n'isi ahụ.","Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ akwọsaghị mmiri n'isi nwereike ime ka isi na-akọ mmadụ ọkọ, ebe ụfọdụ na-eche na ihe niile na-eme ka mmadụ na-akụ onwe ya aka n'isi n'ihi ọkọ na-akọ ya bụ na ""igu dị ya n'isi"" maọbụ na ""dandruff na-enye ya nsogbu"". Mana ị ma na e nwere ihe ruru ọrịa iri na-ata mmadụ arụ n'isi, nke ụfọdụ n'ime ha na-erikwa ntutu mmadụ, na-eme ka ọ na-adasịsị maọbụ ghara ito ogologo? Akụkọ a ga-akọwara gị ihe ndị ahụ na-eri gị nri n'isi nakwa ụzọ ị ga-esi nyere onwe gị aka. Anaghị eji ihe e ji agba na ntị agba n'anya mana e nwere ike iji nke e ji agba n'ahụ agba n'isi: Ọ bụ eziokwu na ị ga-ejinwu ihe e ji agba n'ahụ agba n'isi n'ihi na ala isi gị na anụahụ gị bụkwa otu, mana ọtụtụ mmadụ amaghị nke a. Ụfọdụ ihe ndị a na-ata mmadụ isi nwekwara ndị nke na-ata n'ahụ, nke bụ na i were ihe ị ga-eji luso nke dị gị n'ahụ luso nke na-ata gị n'isi, o butekwa ụdịrị ọgwụgwọ ọ ga-enye gị n'ahụ. 1) 'Seborrheic dermatitis' Eserese a na-egosi ka ọria ndị a na-esi amụbawanye ma n'isi ma n'ahụ mmadụ Sebhorric Dermatitis bụ ọrịa na-ebute oke ọkọ n'isi, nke na-eme ka ala isi mmadụ na-acha ọbara ọbara. Ọ na-adị ka nke Bekee kpọrọ ""dandruff"", mana ebe o si ka njọ bụ na ọ na ọ na-amụba amụba n'isi; o nwekwara ike ime mmadụ ma n'ihu ma n'obi ya (ebe ndị Bekee kpọrọ ""sebaceous areas""). Ebe ọrịa a si ka njọ bụ na ọtụtụ ndị bu ya akpagharị amaghị na ha bu ya. Ọ na-emekwa ma nwoke ma nwaanyị, ọkachasị ndị nwere ntutu. Ọ na-ebidokarị mgbe mmadụ ka malitere ntoroọbịa, mana ndị ọkachamara kwuru na ọ na-akacha enye ụmụnwoke nsogbu. Ụfọdụ oge ọ na-emekwa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ, mana ọ naghị anọte aka tupu ọ laa. Ebe o si dị mma bụ na ọ naghị esi na nne na nna fere na nwa. Gịnị na-ebute ya? E nwere Yist a kpọrọ ""Malassezia"" na-ebi n'ahụ mmadụ nke nwereike ịmụbawanye wee bute ọrịa a. O nwekwara ike ibido ma ọ bụrụ na ihe na-alụso nje ọgụ n'ahụ mmadụ mekarịa ka o si eme ma Malassezia a metụta ya. Ihe na-akpalite ya gụnyere ike ọgwụgwụ nakwa oke ndọkasị ahụ. Ọzọ bụkwa na ọ na-aka akpa ike n'oge njụmoyi karịa na mkpomọkụ. Ọ bụghịkwa ihe mmadụ na-eri na-ebute nke a. Etu e si agwọ ya E ji ihe ndị na-akụda yist ahụ agwọ ya, ihe gụnyere ncha e ji asa isi nakwa ude ọpụrụiche nke a na-arụpụta maka ọgwụgwọ ya. A na-agwọ ya agwọ mana o nweghi ngwọta. Nke bụ na mgbe ị kwụsịrị ịgwọ ya, ọ ga-abịaghachite; mana ala isi gị malite ịchapụ ọcha, ka na-eji ncha isi na-ebughi 'fụngaị' na-asa isi gị ma na-etekwa ude mmiri (moisturiser) kwa izu iji kwụsị mbịaghachite ya. Ọzọ bụkwa na ụfọdụ na-eji maka ya aga ụlọọgwụ ka e nyochaa ma gw ha etu ha ga-esi lekọta ya. 2) Dandruff Ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na dandruff dị ka Seborrhoeic dermatitis ka na-amụ ọrụ. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mgbe isi na-akọ mmadụ ọkọ, na ọ bụ dandruff ka ọ na-arịa, mana o nweghi ihe mebiri n'ihi na ọ naghị efe efe. Ọ bụkwa eziokwu na dandruff na-adasịsị na-adakwasị n'elu akwa ma ị na-akọ ọkọ (ị na-akọ ọ na-atọ gị), mana nke a nwere ngwọta. Gịnị na-ebute ya? Otu ihe ị ga-ama bụ na ọ bụghị iru inyi na-ebute dandruff, mana ọ na-aka apụta ihe ma ọ bụrụ na ị naghị asa isi gị kwa mgbe. Mana njụmoyi nakwa ndọkasị ahụ na-eme ka nsogbu ya karịa. Ihe a kpọrọ Malassezia globosa bụ ihe na-ebute dandruff, nke na-eri mmanụ dị na ntutu nakwa n'ahụ mmadụ. Etu e si agwọ ya Chọọ ncha e ji asa isi nwere ọ bụrụgodi otu n'ime ihe ndị a: zinc pyrithione, salicylic acid, selenium sulphide (maọbụ selenium sulfide), ketoconazole nakwa coal tar. Na-asa isi gị ọ bụrụgodu ugboro abụọ n'ime otu ọnwa; ị tinye ya ncha ahụ hapụ ya ka ọ nọruo nkeji ise maọbụ iri tupu ị sachapụ ya. 3) Scalp Psoriasis Ndị ọkammụta sayensị amabeghi ihe na-ebute ọrịa Psoriasis ndị a na-eme ma n'isi ma n'ahụ, mana ha ma na o nwebeghi ngwọta kpam kpam Ị hụtụla ebe mkpu pụrụ ndị mmadụ n'ọnụ n'ihi na otu onye tọpụrụ isi ọ kwanyere? Nke a bụ otu ọnọdụ scalp psoriasis nwere ike itinye gị n'ime ya. Ọrịa nke a na-asọ itinye ihe Bekee kpọrọ ""Synthetic"" n'isi onye ojii, (gịnị ka nwaanyị ga-etinyezi n'isi ya ebe ọ bụ ya ka e ji emepụta ma ""attachment na weavon"" ụfodụ e ji eme isi?) Ọ na-abụ i tinye ihe n'isi gị ọ malite ikpekasị ma na-akọ gị ọkọ, mana ị kọọ ya ọkọ o nwere ike imerụ gị ahụ maọbụ mee ka ebe ahụ na-akọ gị ọkọ na-acha ọbara ọbara. Ị sịkwanụ ka ị kụwa isi gị kpakam kpakam, ị nwere ike ịkụta isi ọwụwa. Gịnị na-ebute ya? Ndị ọkammụta na-eche na scalp psoriasis na-abịakarị site na mgbe ihe na-alụso nje ọgụ n'ime ahụ mmadụ anaghị arụsi ọrụ ike, nke bụ na mkpụrụndụ nke T ọrụ ya bụ ị na-alụso nje na ọrịa ọgụ ga-ahapụ ya bụ ọrụ ma lụso mkpụrụndụ nke dị mma ọgụ, nke na-eme ka ọ mụbawanye. Mkpụrụndụ ndị ahụ na-apụtazị n'anụahụ mmadụ ebe ọ na-eme ka ọ chaa ọbara ọbara, zaa aza, na-ekpekasị ekpekasị ma na-akọ ajọ ọkọ. Ha na-echekwa na ọ na-esi na mkpụrụndụ efe efe ma ọ bụrụ na nne na nna onye nwere ya. Ọzọ bụkwa na etu onye si ebi ndụ na-ebutekwa ya; dịka onye na-ese anwụrụ, onye aṅụrụma, onye buru oke ibu nakwa onye nọ n'oke ihe mgbakasị ahụ nwere ike ibute ya. Etu e si agwọ ya Scalp psoriasis na-eri ntutu mmadụ, mana ọ na-etochikwa ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-elekọta isi ya ọfụma. A na-eji ihe ndị nwere Anthralin, Calcipotriene, Betamethasone, Tazarotene, Methotrexate, Oral retinoids n'ime ọgwụ ọṅụṅụ, agwọ ya. Ọzọ bụ nke a kpọrọ Phototherapy. Ị nwekwara ike iji ụfọdụ ihe dị n'ụlọ gị gụnyere aloe vera, apple cider vinegar, baking soda, mmanụ akị oyibo, garlic, oatmeal, nnu epsom, turmeric nakwa mmanụ osisi tii agwọ ya. 4) Ringworm (Tinea Capitis) Nke a bụ nke ndị Igbo na-akpọ ọkpụ isi oringo. Ọkpụ isi oringo bụ nke a na-akpọkwa Tinea capitis maọbụ ringworm, bụ nje fungus na-enye isi na anụahụ mmadụ nsogbu. Ọ bụ eziokwu na ikpuru dị n'aha ya (ringworm), mana ọ bụghị ikpuru na-ebute ya bụ ọrịa. Ọ na-egosikarị dịka ihe gbara gburugburu na-acha ọbara ọbara, na-erikwa ntutu mmadụ ihe o richatara. Ọ na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ nakwa anụmanụ, ọ na-emekarị ụmụaka mana ọ na-emekwa okenye. Gịnị na-ebute ya? Ọ bụ nje a kpọrọ dermatophyte na-ebute ya, nke na-eme ka ọ na-akọ ezigbo ọkọ. Etu e si agwọ ya Ọtụtụ oge a ga-eji agụba a ga-atụfu ozugbo kpụchaa gị akụkụ isi ebe ọ na-eme gị tupu agwọwa gị ya, mana ozi ọma bụ na o nwere ngwọta. A na-eji ude e ji etegbu nje nakwa ncha e mere maka ịsa isi bu nje asagbu ya. Ụfọdụ na-aṅụkwara ya ọgwụ. Gbaa mbọ hụ na gị na onye nwere ọkpụ isi oringo ekeghi otu mbọ isi, okpu, ejighi otu akwa ehicha ahụ nakwa edinaghị n'otu akwa. 5) Isi nkwọcha (Alopecia) Bandile siri na ọ bụrụ na o jiri nwaayọ, na isi nkwọcha ya agaghị eru etu a. Alopecia bụ aha a na-akpọkarị ndapụ ntutu n'ụzọ dị iche iche. Mana ozi ọma so ya bụ na o nwere ngwọta ụfọdụ oge, ma i lekọta ntutu gị ọfụma. Gịnị na-ebute ya? Ụfọdụ oge ọrịa na-ebute mfopu ntutu, ndọkasị ahụ na-ebutekwa ya. Ụfọdụ oge onye na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa kansa na-enwekwa ọrịa alopecia a; ọzọ bụkwa na oke ibu na-emekwa ka ntutu ndị mmadụ na-adapụsị, ọzọ bụkwa onye iron ezughi oke n'ime ahụ ya. Etu e si agwọ ya A na-eji Finasteride na minoxidil agwọ isi nkwọcha n'ụmụnwoke, na-eji minoxidil agwọ ya n'ụmụnwaanyị (Finasteride adịghị nwaanyị mma n'ahụ) A na-ejikwa nke Bekee kpọrọ Immunotherapy (bụ ite kemịkal n'elu ebe kwọchara akwọcha) agwọ ya, nakwa nke a kpọrọ steroid (ma ude ya ma ntụtụ ya). Ụfọdụ na-eme nke Bekee kpọrọ ""hair transplant"" nke bụ iweta ntutu ọzọ rụnye ya n'isi gị. 6) Igwu (Lice) Foto a na-egosi igu yiri akwa na ntutu mmadụ A na-ahụkarị igwu n'isi ụmụaka n'ihi etu ha na-esi egwukọta egwu. Ọ bụghị inyi na-ebute ya, kama ọ na-efe efe. Ọ na-akọ ezigbo ọkọ, na-adị ka enwere ihe na-agagharị gị na ntutu, mana a na-eji mbọ nwere eze kịrịkịrị achọta ya na ntutu mmadụ. Etu e si agwọ ya Ncha ọbụla e ji asa isi ga-agwọnwu ya. Bọọ isi gị nwayọ nwayọ oge mmiri ka dị n ya, ruo mgbe ị bọpụchara ya. Mmanụ osisi tii, mmanụ eucalyptus nakwa nke lavenda na-enyekwa aka. Ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ nwere ike iri gị nri n'isi maọbụ mee ka ntutu gị na-adapụ gụnyere ndị: Ụgwọ bụ nke Bekee kpọrọ Eczema, Impetigo, Folluculitis nakwa Isi nkwọcha ụmụnwaanyị bụ nke Bekee kpọrọ ""Female pattern baldness"". Otu ihe e nwere iji elekọta ụfọdụ n'ime ọrịa ndị a bụ ihe Bekee kpọrọ ""Emollients"". Gịnị ka ọ bụ? Emollients bụ ihe nwere dịka ude mmiri a na-etekwasị n'ahụ iji wetulata mmefu mmiri dị n'ahụ mmadụ, ma jirikwa ya na-ekpuchite nakwa echekwa anụ ahụ. A na-ejikarị ya elekọta ahụ na-ekpekasị ekpekasị maọbụ ahụ mmiri kọrọ. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ezigbo nri ị ga-eri ma ị chọọ inwete ntutu na mbọ ahụ dị mma" media-43943182,https://www.bbc.com/igbo/media-43943182,Popu Francis etinyela ọnụ na mkpamkpa mere ndị ụka Benue,Onyeisi ndị ụka Katolik bụ Popu Francis ekwuola na obi adịghị ya mma maka ndị ụkọchụkwụ abụọ na mmadụ 16 ndị ọzọ ndị ochịehi gburu na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epurel.,"Popu Francis N'ime ozi ya ụbọchị ụka n'ama Petersquare, Pop Francis kpere ekpere ka udo laghachị n'otu ndị ụka Kraist. Popu dere na twitter na ogbugbu mmadụ a bu ọrụ ekwensu. Cheta na ndị ọchịehi gburu Ụkọchukwu Joseph Gor na Felix Tyolaha, na mmadụ 16 ndị ọzọ ka n'ụlọụka St Ignatiuas n'obodo Mbalom na Benue steeti. Onyeisiala Naịjiria bụ Mohammadu Buhari agaala mba Amerika ugbua, akụkọ na-ekwu na nchekwa obodo ga-eso na mkparịtaụka ya na Donald Trump. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-53029621,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53029621,Violence by stabbing: 'Echere m na m gaara anwụ mgbe a sụchara m mma ugboro 12',Peter Molokwu bi na mba ofesi a sụrụ mma ugboro iri na abụọ kọwara ihe ọ gabigara n'ọnụ ọnwụ dịka ọ nọ n'ụlọọgwụ.,"Ọ sị nọ bụ otu nwoke ya na ya nweburu esemokwu wakporo ya n'ụlọọrụ ya ma were mma sụkasịa ya ahụ, ihe ruru ugboro 12. O kwuru na mgbe nke a mere na o maghị na ọ ga-adị ndụ ọzọ na ezinaụlọ ya chere na ọ nwụọla. Molokwu sị na ahụ ọ merụrụ dị ukwu nke mere ka ndị dọkịta chee na ọ ga-anọ ụlọọgwụ ihe ruru ọnwa isii. Kirie ihe o kwuru n'uju: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49745318,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49745318,Xenophobia: Ụmụafọ Naịjirịa ọzọ esila Saụt Afrịka lọta,"Ụmụafọ Naịjirịa dị narị atọ na iri na anọ esila mba Saụt Afrịka lọta Naịjirịa n'ụbọchị Tuuzde 18 Seputemba, 2019.","Ụgbọelu Air peace bu ha wuchiri n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs n'ihe dịka elekere asaa nke abalị. Onyeisi ụlọọrụ Naịjiria na-enye ikike njem na mba Saụt Afrịka bụ Anthony Ogbe nọkwa n'ụgbọelu ahụ mgbe ọ lọtara. Abike Dabiri bụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ndị Naịjiria nọ na mba ofesi nọkwa n'ọdọ ụgbọelu ahụ ịnabata ha. Abike Dabiri kwukwara na gọọmentị steeti dị iche iche nọkwa ebe ahụ ịnabata ndị nke ha. O kwukwara na ha ga-enye ndị niile lọtara ego iji gbaa ụgbọala, nri oriri nakwa 'sim kad' ọhụrụ." afirika-50703738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50703738,Cultural display: Lee ka esi mee mmemme Olu na Delta steeti,Omenaala dị iche iche mana ịhụtụla ebe e were ọkụ tinye n'ite mmadụ bu n'isi ya?,"Ọ bụ nke a na ihe ndị ọzọ gbara Igbo gharị ka anyị hụrụ na mmemme olu bụ nke e ji echeta mmeri n'agha oche Ebu dị na Delta steeti gara n'oge dị anya. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiemela Peters Mgbeahuru na Nnamdi Kelechi Agbanelo Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-47609098,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47609098,Nigeria Customs: Lee nwoke Kọstọm e buliri elu n'ihi na ọ jụrụ ịnara akaazụ,Kọstọms ebuliela otu onye ọrụ ha a kpọrọ Bashir Abubakar maka ịkwụwa aka ọtọ.,"Hameed Ali bụ onyeisi ngalaba Customs kwuru na ịgbajọ ego akazụ ahụ gosiri na ihe ga-abara oha mmadụ uru dị Abụbakar mkpa. Abubakar gbajọrọ ihe ruru puku narị naira anọ n'ọma ndị na-ezobata ahịa chọrọ inye ya iji kwe ka ngwa ahịa ha gafere. Ha gwakwara Abubakar na ọ bụrụ na ọ mee nke a, ha ga-enye ya ego karịrị nke a. Abubakar jụrụ ego ahụ ma jichie igbe ahịa riri iri anọ bụ ọgwụ Tramadol abata na Naịjirịa." 45758367,https://www.bbc.com/igbo/45758367,Lee iwu CBN ise e nweghị ihe e ji ya kpọrọ,"Iji buo agha megide ire ego ọhụrụ, ibọ ya abọ nakwa ụzọ ndị ọzọ e ji emetọ ego Naịjirịa ụlọakụ etiti bụ CBN na-akwado ibido ụlọikpe ga na-agagharị ikpe ndị na-ere ego maọbụ ndị na-emetọ ego Naijiria.","Onye dara iwu ịbọ ego ga-ada nha N50,000 maọbụ mkpọrọ isii Onyeisi ụlọakụ FSDH Merchant Bank bụ Hamda Ambah, kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu kwuru na CBN na ndị uweojii na Mịnịstrị na-ahụ maka ego ga-arụkọ. N'okwu ya onyeisi mgbasaozi CBN bụ Isaac Okoroafor kọwara na iwu dịbu adị kama na ọ dị mkpa ha na ndị uweojii ijikọ aka iji hụ na a gbasoro ya. Okorafor sị, ""Nke a bụ ichetara ndị mmadụ na o megidere iwu CBN nke afọ a ire, ịbọ maọbụ ịdọka ego Naịjirịa. ""A ga-eri onye mere yaa iwu dị N50,000 maọbụ tụa ya mkpọrọ ọnwa isii maọbụ mee ya ha abụọ. ""CBN nọ n'isi n'ịhụ na a agbasoro iwu ahụ n'ihi na a na-emefu nnukwu ego ibi ego ọhụrụ. ""Ọ bụrụ na ya bụ ihe bụ omenala, ọ ga-akwụsị. Ọ bụrụ omume, a ga-agbanwe ya."" Mana ọ bụghị nke mbụ CBN na-ama iwu nke ọ nweghị ihe ejiri ya kpọrọ Lee iwu CBN enweghị ihe e ji ya kpọrọ: 1. Iwu CBN nke afọ 2007, akụkụ nke 20 na 21 machiri ịtụ mgbere ego, ịbọ ego na mmemme maọbụ ijikọ ego Mana e nwere ọtụtụ ndị ahịa na-ere ego na enweghị mgbochi ọbụla, ebe ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị welitere isi na-abọ ego na mmemme na enwegghị ntarahamahụhụ ọbụla. 2. Iwu CBN machiri mmadụ inye mmadụ akwụkwọ ego(cheque ) ma ego adịghị n'akpaego onye nyere ya nke a kpọrọ dud cheque na bekee Iwu nyere mkpọrọ afọ abụọ maka onye dara iwu. Agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ na ụlọahịa na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ego ego adịghị, ebe ndị ụlọakụ na-agba ha ikpe ha dịka iwu siri kwuo na enweghị ntarama ahụhụ ọbụla. Mana na nsonso, a kpụpụrụ otu nwoke ụlọikpe maka inye ego akwụkwọ ego ego adịghị na Legos. 3. Iwu machiri ụlọakụ iwepụ ego ndị mmadụ tinyere n'ọbaego n'ụzọ ekwesịghị ekwesị Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akwụ ego karịa ka ọ kwesịrị maka iwere ego n'igwe ego abụghị nke ụlọakụ gị Iji maa atụ CBN nyere iwu ka a kwụọ N4 maka ozi ekwenti(SMS alert maka ihe ego ọbụla mmadụ mere n'akpaego ya ma nye iwu na ozi ọbụla gbasara otu ihe mmadụ mere n'akpaego ya. Mana ọtụtụ ụlọakụ na-ezi ọtụtụ ozi ekwenti maka otu mwepụ maọbụ ntinye ego n'akpaego onye na atabighị anya ọbụla. 4. Ụfọdụ ụlọakụ na-ehinwe igwe ha ka ọ kwụ gị naanị N10,000 n'igwe ego (ATM) ka ndị mmadụ nwere na-akwụ N65 maka iwere n'igwe ego abụghị nke ụlọakụ gị Mana o nweghị ntaramahụhụ CBN na-enye ụlọakụ ndị a ji aghụghọ anapụta ndị mmadụ ego. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46300210,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46300210,Southeast Railway: Senate kpọrọ Amaechi oku maka ụgbọoloko n'Alaigbo,Ụlọomeiwu ukwu akpọọla Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechị ka ọ bịa kọọwara kọmiti na-ahụ maka ego mgbazinye na ụgwọ eji ndị mba ọzo ihe kpatara ụgbọoloko ga-eji na-akwụ ụtụisi n'okpọrọ ụzọ ụgbọ si Pọtakọtụ gawa Medugri.,"Rotimi Amechi minista na ahụ maka njem Achọpụtara na-ọnọdụ nkwekọrịta eji abado ọrụ ịrụzị ụzọ ụgbọoloko n'ọwụwa anyanwụ abụghị otu na ka esi arụ ebe ndị ọzo na Naịjirịa. Eji ego mgbazi sị mba China arụ ụzọ ụgbọoloko ndị ọzọ na Naịjirịa. Ụlọomeiwu ukwụ nyere ikike ka enwere ego mgbazita ndị China were rụzie ụzọ ụgbọoloko, mana ndị omeiwu chọpụtara na Muhammadu Buhari si ụzọ ọzọ arụ nke ndị ọwụwa anyanwụ, dị ka akwụkwọ ndị ntaakụkọ Guardian akụkọ The Guardian siri dee. Akwụkwọ akụkọ dere na ọrụ ngo nke a bụ nke Bekee kpọrọ Public Private Partnership (PPP). Nke a pụtara na ndị China bụ ndị wetere ego eji bado ya bụ ọrụ ga-akpọrọ isi ego ha mgbe ụgbọ gbawara. Ọ bụ Sinatọ Ekweremadụ bụ onye nọchite anya Enugwu West bụ onye tụpụtara alo a. Mgbe ọ na-ekwu okwụ a, Ekweremadụ chetere na ọteela aka ya bidoro mawa ya bụ ọkwa n'ụzọ esi abado ọrụ imezi ụzọ oloko na mpaghara ọwụwa anyanwụ akwụchaghị ọtụ. Ụzọ ụgbọoloko Ụzọ oloko Ekweremadu mara ọkwaa gụnyere Port Harcourt - Enugu - Markudi nakwa Yola na Maduguri gawara Delta, Plateau nakwa ụzọ Nasarawa steeti. Ngbe okwuru ihe a, ihe asara ya bụ na ndị Gnereal Electric (GE) ga-eweghara mpaghara ahụ. Mana ndị omeiwu a chetere na nkwekọrịta GE na ndị gọọmenti mara afọ n'ala nke mere GE jiri gbaa arụkwaghịm. Ekweremadụ chetere na ya bụ ọrụ ngọ nke ụzọ Legọs gawa Kano nke ọwụwa anyanwụ natakọtara ikike n'ụlọ omeiwu otu mgbe, ""Mana ugbua egwu ọkụkọ ahụla Igbo puo eze"", dịka Ekweremadụ siri kwuo. Ekweremadu kwuru na ""ugbua, ihe asizi ndị China mee bụ ha were ego ha rụọ ya bụ ụzọ ụgbọoloko ma kpọrọ ego ha mgbe ụgbọ gbawara."" Ọ sị na mba ọbụla na-eme ụdi ihe a agaghị anyandụ. Mbọ niile BBC gbara ịnwete ndị ọrụ ngalaba na-ahụ maka njem maka ịzara ọnụ ha nara na-iyi. Akụkọ ga-amasị gị Uche Nwosu kwuru na ọ bụ ya ka ga-anọchite anya APC n'Imo steeti" afirika-48427443,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48427443,Nigeria vs USA: Ụmụ Amerịka ejirila Flying Eagles gbaa okoso na Poland,Otu egwuregwu Naịjirịa na-achọchite anya ha n'asọmpị akpọrọ Fifa Under 20 World Cup a na-agba na mba Poland na ogbo ha nke mba Amerịka zutere taata n'agba nke abụọ ha.,"Agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe nchekube na Naịjirịa ga-eme ọfụma n'asọmpị a maka ha ji Qatar kwọcha aka mgbe ha zutere, dịka Amerịka dara na nke ha na Ukraine, ụmụ Super Eagles ahụghị ụkwụ ha. Ọ bụ ka a ka ji nkeji iri na asaa banye ya bụ asọmpị ka Sabastian Soto kpịakara goolu Naịjiara. Ka a ka na-ekwu nke o mere, n'agba nke abụọ, Soto ekweghịdị ka ụmụ Naịjirịa metụ bọọlụ ụkwu tupu o nye goolu abụọ ya nkeji 46. Na nkeji iri na ise, agbaturu nwafọ Naịjirịa bụ Kingsley Michael n'ọnụ goolu Amerịka nke mere onye na-egbu bọọlụ jiri ga-ịgba ihe onyonyo Bekee kpọrọ VAR ajụjụ o were si na ọbụghị penarịtị. Naịjirịa na Ukraine ga-ezute dịka USA na Qatar ga-ezute n'agba nke atọ." afirika-43417840,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43417840,SAFA ga-eme ntụlịaka na Maachị,Otu na-achị egwuregwu bọọlụ na mba ụwa akpọrọ FIFA na bekee ekwuola na ha na ndị South Africa Football Association SAFA enweela nkwekọrịta gbasara ntụlịaka nke otu ha.,Gianni Infantino banyere ọkwa ọchịchị FIFA n'afọ 2016 FIFA kwuru na SAFA ga-enwe ntụlịaka ọhụrụ n'ụbọchị iri abụọ na anọ n'ime ọnwa Maachị. Onye isi ndị otu egwuregwu bọọlụ na mpaghara ndida Afrika akpọrọ Council of Southern Africa Football Associations na bekee bụ Phillip Chiyangwa gwara ndị nta akụkọ na ha nwere nkwekọrịta na isi ụtụtụ taa. Akụkọ kwuru na nsogbụ bidoro oge ụlọọrụ na-ahụ maka ntụlịaka nke otu ha kwuru na ntụlịaka a anaghị eme ọzọ. Akụkọ kwukwara na SAFA na-akwadebe ị ga ụlọikpe maka okwu a. Ihe a mere ka FIFA tinye aka maka ị dozie ya bụ okwu. FIFA kwuru na komitee ntụlịaka ọhụrụ ga-ahụ maka ntụlịaka ga-eme n'ihu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 42850925,https://www.bbc.com/igbo/42850925,Federer ebuliela iko egwuregwu Australian Open,Roger Federer meriri Marin Cilic na asọmpị ikpe-azụ ịjị were merie asọọmpi Tennis nke a na-akpọ 'Australian Open'.,"Ọ sị ndị otu ya na obi diya ụtọ na mmeri a Federer malitere ịbe akwa mgbe ebunyere ya iko mmeri nke a, ndị mmadụ akpọọa ya ""onye dị obi ume ala"". Oji ohere a were kene ndị kwudoro ya n'azụ na sị ha ""Daalụụ nụ, ahụrụm ụnụ n'anya"". Mmeri ya nke a n'ewu ewu n'elu ssocial media." afirika-56951096,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56951096,Madam Social: Mkpọnwụ ahụ m agaghị akwụsị m ịkpa ndị mmadụ ọchị,Madam Social dị afọ 80 na-ewu ewu ọfụma na soshal midia maka etu ya na nwa nwa ya si akpa ndị mmadụ ọchị.,Ọ gwara BBC Igbo ihe mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị na nka. Ọ sị na o ruru n'afọ 2019 mgbe ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ na nke a gbawara obi mere o ji daa n'ọrịa mkpọnwụ ahụ bụ 'stroke'. Madam social sị na nke a mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị iji chụọ ọbara mgbalielu na-agbanyeghi ọrịa ọ na-arịa. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu Uzu na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: egwuregwu-45878598,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45878598,Nigeria vs Libya: Super Eagles bụzị ndị isi Group E,Naịjirịa abụrụla ndị nọ n'isi Group E n'asompi eji amara ndị ga-etozu ịga iko mba Afịrịka nke Bekee kpọrọ African Cup of Nations nke 2019.,Naịjirịa bụzi ndị nọ n'isi Group E Nke mere kaotu bọọlụ Super Eagles ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie Libya n'asompi agbara na Tunisia taa. Ndị nọ bụ n'isi Group E bụ South Afrịka na ogbo ha bụ Seychelles gbara nhatanha na ọdọ egwuregwu Linite dị na Victoria. Bafana Bafana jiburu 6-0 gbaka Seychelles ahụ na-agba nke mbụ ha. Naịjirịa ji ọkpụ atọ asataghi merie Libya na-agba nke mbu ha na Naijirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-53627240,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53627240,Mpụta Laycon akpanyela ọkụ n'ama na Legọs,Okporoụzọ dị na Legọs nwuru ọkụ ụbọchị Fraide dịka Laycon pụtara mbụ ya n'ama kemgbe o jiri merie na asọmpi Big Brother Naija.,"Igwe mmadụ pụtara n'igwe n'okporoụzọ ụfọdụ na Legọs ikele Laycon onye ezi aha ya bụ Olamilekan Agbelesebioba dị ka ebe onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-achụmnta vootu. End of Twitter post, 1 ụfọdụ ụ̄ụụ ya n'ụzọ CMS gbara ama na ndị hụụ ya na-etu ya aha, ebe ụfọdụ kwara ya ụzọ ka o nwee ike gafere na enweghị mgbochi ọbụla. Legọs na Ọgun na-azọ onye Laycon ga-akwụ ụtụisi n'ego o ritere Ụlọọrụ na-anakọ ụtụisi na Legọs bụ 'Lagos State Internally Revenue Service' (LIRS) na nke Ogun steeti bụ Ogun State Internal Revenue Service(OGIRS) na-azọ Onye ego ụtụisi Laycon ga-aba n'akpa ya. Ụlọọrụ na-anakọ ụtụisi na Legọs kpọburu Laycon nke 'Big Brother Naija' oku ka ọ kwụọ ụtụ isi na-ego o ritere n'asọmpi 'Big Brother Nigeria'. N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha, LIRS kelere nwa amadi ahụ maka imeri na 'Big Brother Naija.' Ha gara n'ihu chetara Laycon, onye ritere nde Naịra iri asatọ na ise (N85m) n'ihe ejije ahụ na ọrụ dịrị ya dịka onye bi na Legọs, sị ""Anyị na-ele anya ịhụ gị n'afọ 2020 dịka ị na-akwụ ụtụisi gị."" Ozi LIRS nke na-abịa abalị atọ Laycon merichara n'asọmpi ahụ gbadoro ụkwụ n' Iwu Naijiria nke mere ya iwu mmadụ ịkwụ pasent abụọ na ọkara ihe o ritere n'ọrụ ya kwa ọnwa. Ụlọọrụ na-anakọ ụtụisi n'Ogun State bụ 'Ogun State Internal Revenue(OGIRS) ekweghị ka ozi nke LIRS jụọ oyi tupu ha zip u nke ha nke kwuru na ha na-eche Laycon maka ụtụisi n'afọ 2021. Cheta na Laycon ritere ego dị nde iri atọ(bụ ego ahụrụ anya nakwa ihe onyinye ego ya dị N55m. O ritekwara ụgbọala SUV si n'ụlọọrụ Innoson nakwa ụlọ ọnụ abụọ nakwa ihe ndị ọzọ. Ozi ahụ si n'aka LIRS bulitere ndọrịtaụka na soshal midia. Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka ya Ụfọdụ si na ihe Laycon nwetara abụghị site n'ọrụ na ọ bụ ihe onyinye. @Mr_Olufemi_ kwuru na BBN abụghị ọrụ maọbụ azụmahịa gọọmenti ga-ele anya ịnara ụtụisi. Mana ụfọdụ dị ka @ibi1shan sị na BBN bụ ọrụ nke pụtara na ego nrita ahụ dịka ụgwọ mmadụ ritere n'ọrụ. N'ozi OGIRS mere, ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ ya. Gọvanọ Delta steeti ebunyela Dorathy ụkpa ekele pụrụiche ""Dorathy bụ ezi onye nnọchiteanya steeti anyị"" bụ ihe gọọmentị Delta steet dere n'akwụkwọ ozi ha wepụtara iji kelee Dorathy na Neo. Dorathy sị na steeti ahụ bụ onye ritere ọkwa nke abụọ na ngwụcha asọmpị 'Big Brother' bịara na njedebe n'ụbọchụ ụka. O tinyere ya bụ ozi n'akara Instagram ya ma kelee gọọmentị steeti ya maka ihuọma a ha wetara ya. Cheta na Dorathy na-ewu n'ehihie ụbọchị Monde maka okwu o kwuru na dimkpa abụọ bụ Brighto na Kiddwaya chabara ya anya n'ime ụlọ 'Big Brother'. O kwuru ya mgbe Ebuka gbara ya ajụjụ ọnụ maka onye masịrị ya n'ime ụmụ nwoke niile nọ n'ụlọ ahụ. Ndị a ma ama ebunyela Laycon ekele maka mmeri ya Ndị ama ama n'ihe nkiri Nollywood gụnyere Don Jazzy , Regina Daniels, Korede Bello ekelela Laycon n'ụzọ pụrụ iche maka mmeri ya na Big Brother 2020. Mercy Eke bụ onye meriri Big Brother nke 2019 kelere Laycon na twitter ya. Don Jazzy kwuru na ọ bu ụkpa ekele ebunye Laycon na ndị niile kwadoro ya mgbe ọ nọ n'ime ụlọ Big Brother. Regina Daniels bụ onye na-eme ihe nkiri Nollywood kwuru na Laycon bụ onye agọziri agọzị makana ọ bịara iwulite egwu ya mana ọ mechara bụrụ onye mmeri. Ayo Makun e ji AY mara dịka ọkpaọchị kwuru na ọ bụ amara chineke nyere Laycon aka. Akpụ obi abụghị ihe niile, Laycon emeriela BBNaija nke 2020 Olamilekan Agbeleshe onye e ji Laycon mara eturula ugo n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ 2020. Laycon bụ ya nwetere vootu kachasị n'egwuregwu nke afọ a. Ihe nrite dị na mmeri a Laycon nwetere ruru nde naịra iri asatọ na ise (N85 million). Ọ bụ Laycon na Dorothy bụ mmadụ abụọ fọrọ n'ụlọ BBNaija oge a chụpụchara ndị ọzọ. Mana oge e gosiri etu ndị mmadụ si tụọ vootu. ọ bụ vootu nke Laycon karịrị. Etu okwe si gbaa Mmadụ ise fọdụrụ n'ime ụlọ BBNaija ruo ụbọchị ikpeazụ. Ha bụ Neo, Nengi, Laycon, Dorothy na Vee. Vee bụ ụzọ pụọ n'ụbọchị ikpeazụ nke BBNaija 2020 Vee bụ onye nke mbụ e nyere ọsọ n'egwuregwu BBNaija nke afọ 2020. Victoria Medise, bụ ezigbo aha Vee, nwetara vootu kacha nta. N'agbanyeghi na Vee eturughi ugo n'egwuregwu a, o ritere ọtụtụ ihe nrite ndị ọzọ. Otu n'ime ha bụ nde naịra abụọ nke ụlọọrụ ntutuisi a kpọrọ Darling Hair nyere ya oge o meriri n'egwuregwu nke ụlọọrụ ahụ kwadoro. Neo bụ onye nke abụọ a chụpụrụ n'ụbọchị ikpeazụ Onye ọzọ a chụpụrụ bụ Neo, onye ezigbo aha ya bụ Emuobonuvie Akpofure. Neo bụ otu onye ọtụtụ mmadụ atụghị anya na ọ ga-eru n'ụbọchị ikpeazu. Ọzọ dịka ibe ya bụ na Neo na Vee malitere ịkpa dịka enyinwoke na enyinwaanyị oge ha abụọ nọ n'ime ụlọ BBNaija. Mana oge Ebuka jụrụ ha ma ha a ga-aga n'ihu ugbu a ha pụtara, ha abụọ kwuru na ha ga-eji nwayọ nwayọọ rachaa ya bụ ofe dị ọkụ. Nengi bụ onye nke atọ a chụpụrụ n'ụlọ BBNaija nke 2020 Onye nke atọ a chụpụrụ n'ụbọchị Sọnde bụ Nengi. Nengi, onye ezigbo aha ya bụ Rebecca Hampson, gbara afọ iri abụọ na abụọ. Tupu o sonye n'egwuregwu a, ọ bụ onye ojiegoachuego nke bekee kpọrọ 'Entreprenuer'. Nengi gụrụ na mahadum Port Harcourt. O kwuru na ebe dị ọcha na-amasị ya nakwa ọ na-amasị ya i gosi ihe ọ bụ n'ezie kama i bi ndụ agwọ. Mgbe e neyere Ozo na Tricky Tee n'ụlọ Big Brother Naịja 2020 Ọzọ na Trikytee abụrụla ndị 14 na 15 a na-achụpụ n'ụlọ Big Brother Naija Lockdown. Ozo bụ onye a chụpụrụ ka a chụpụchara Trikytee kwuru na ihe chere ya n'ihu bụ ihe gbasara ịkwalite egwuregwu na Naịjirịa nakwa n'Afrịka. O kwuru na ihe mere o ji na-achụgharị Nengi n'ike n'ike bụ na ọ hụtubeghi nwaanyị dị ka ya mbụ. Na ọ ma ihe mana ọ naghi egosi onwe ya dịka onye ma ihe, ma kwuo na Nengi dị ka ọkụ ebe yanwa dị ka mmiri oyi, nke bụ na ha bịakọta ọnụ na ha ga-ebidonwu ezigbo ezinaụlọ. Trikytee Cheta na ọ bụ ya na Laycon, Dora na Ozo ka a họpụtara nwereike ịbụ ndị a na-achụpụ n'ụlọ Big Brother Naija Lockdown, season 5, n'izu a. O kwuru na ugbua ọ pụtara, na ọ ga-etinye uchu n'ihe gbasara imepụta ejije ọ na-eme nakwa iti egwu etu o si agụbu. Awara m ike mana onweghi onye ọ gbasara - Nengi Otu n'ime ndị so n'emume Big Brother Naija bụ Nengi sị na ọ bụ eziokwu na o buliri ike ya elu nke a kpọrọ 'Liposuctiom'. Ọ sị na ọ chọghị ịma ma ndị mmadụ chọrọ iji ya akọ ya ọnụ, na nke ahụ agbasaghị ya. O kwụrụ nke mgbe ya na ndị ibe ya na-akparịtaụka n'ụlọ Big Brother Naija. Mgbe ha jụrụ ya ego ole o mefuru iji bulie ike ya elu, o kweghi agwa ha ego ole o mefuru. Gịnị bụ 'Liposuction'? 'Liposuction' bụ ụdị ịwa ahụ a na-eji ihe mịrị abụba dị mmadụ n'akụkụ ahụ dịka afọ, ukwu, apata, ike, ụkwụ dgz. A na-eji ya edozie ahụ ka ọ kpakọọ ọnụ mana ọ bụchaghị ụzọ ka mma iji ata ahụ. A chụpụla Prince Enwerem na Kidd Waya n'ụlọ Big Brother Naija Lockdown nke Season 5. Nchụpụ a mere ha onye nke 12 na 13 a na-achụpụ n'ụlọ Big Brother Naija. Ndị ọzọ burula ya ụzọ pụọ gụnyere Lilo, Ka3na, Eric, Tochi, Kaisha, Praise, Wathoni, Tolanibaj, Bright O na Lucy (cheta na a chụpụtara Erica n'ụzọ ọzọ ka ọ dara iwu Big Brother). Kiddwaya Kiddwaya gwara Ebuka na o nweghi ihe jikọrọ ya na Nengi, na ọ naghị ahụta ya ka onye ọ chọrọ ịyị. Otu ihe agaghị eji echefu ya bụ nri ndị ọ na-esi nakwa etu o si agba egwu kwa Satọde ọbụla, nakwa etu ya na Erica si na-eme enyi. Ka a jụrụ ya ihe ọ ga-eme ugbua ọ pụtara bụrụzịa onye a ma ama, o kwuru sị na ọ chọgodiri ibu ụzọ gaa ebe a na-akpụ ụzụ, ka o nwee ike inweta onwe ya, tupu o mewezia ihe ndị ọzọ chere ya n'ihu. Prince Otu ihe agaghị eji echefu ya n'ime ụlọ ahụ bụ etu o si agbabi waya n'ọgbọ egwu n'abalị Satọde ọbụla. Ọzọ bụkwa etu o si elekọta ntutu ndị ya na ha bi n'ụlọ Big Brother; ọ na-akpa ndị nke nwaanyị isi, ma na-akpụ ndị nke nwoke isi. N'ihe ọ chọrọ ime gawa n'ihu ka ọ pụtara n'ụlọ ugbua, Prince kwuru sị na ọ chọrọ ịdị ka Ebuka Obi-Uchendu, mana nke ma eme ejije. O kwuru na ọ nwere olileanya imepe ebe a na-eme isi, ị na-akọ ugbo, nakwa ị na-eme nkwuputa n'ọha. Gị bụ onye sị na m kiriri Big Brother Naija, ị ka m agụ Bible? - Fada Mbaka Ụkọchukwu na-elekọta Adoration Ministry Enugwu bụ Rev. Fada Ejike Mbaka adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara iji aha ya akọ asịrị na soshal medịa n'ihi na o tinyere ọnụ na Big Brother. Mbaka kwuru nke a oge ọ na-eme ekpere ụbọchị Wenezde ya bụ 'e no dey again"" n'ụbọchị sept 9. O kwuru na ọ bụ ihe ọ hụrụ n'isi Erica na Laycon nke Big Brother ka o kwuru, nke bịakwaranụ na mmezu iji gosi na ọ bụ onye amụma. Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịdị na-akpari onye ya na chi ya dị na mma. Ị ga-echeta na n'ụbọchị ụka gara aga ka Fada Mbaka ji esemokwu dị n'etiti Erica na Laycon nọ na Big Brother Naija wee kuzie nkuzi gbasara mgbaghara. Na ya bụ ozioma, ọ katọrọ agwa Erica wee si na ebe ọ bụ na ya bụ nwagbọghọ enweghị mgbaghara, na ọ gaghị ahụ ego nrite ahụ bụ 85m anya. Ngwa ngwa awa ole ma ole gara, a chụpụrụ Erica na BB Naija, nke mere ndị mmadụ jiri katọọ ya bụ ụkọchukwu nke ukwuu. Mbaka kwuru na ọ bụ ndị ọbịa bịara n'ụlọ ya mere o jiri kirie BBNaija ahụ wee hụ ajọ agwa dị iche iche ha na-akpa. Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ibutere onwe ha abụmọnụ site n'ide akụkọ asị gbasara ya. Ọ jụrụ ndị na-akatọ ya ma ha aka ya agụ akwụkwọ nsọ, ma ha aka ya ebu ọnụ ma ọ bụ ekpe ekpere nke nyere ha ike ịkatọ ya. O jikwa ohere ahụ kwuo na ya agbagharala ndị niile na-akatọ ya na soshal media n'ihi na ha amaghị ihe ha na eme. Kiddwaya merie BBNaija, ọ ga-eke ego ahụ ọkara nye Erica otu - Terrywaya Kiddwaya, Terrywaya na Erica Ide ego a ma ama bụ Terry Waya, ekwuola na ọ bụrụ na nwa ya nwoke bụ Kiddwaya merie egwuregwu Big Brother Naija, ọ ga-eke ego ahụ abụọ nye Erica otu. Waya kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ bụ Dele Momodu nwere. O kwuru na Erica bụ nnọọ ezigbo mmadụ nwere agwa ọma ma hụkwa Kiddwaya n'anya nke ukwuu. Waya gara n'ihu kwuo na ọ bụ ebe Erica na-achọ ichekwa Kiddwaya ka o ji daba na nsogbu nke mere e ji chụpụ ya n'ụlọ BBNaija. O kwuru sị: ""Kiddwaya bụ mmadụ obi sarịsarị, ọ na-ahụ mmadụ n'anya, ọ naghị ekweta na mmadụ ọzọ na-eburu ya ihe ọjọọ n'obi."" ""Mana Erica chọpụtara na ọ bụghị ndị niile ha na Kiddwaya na-achịkọ ọchị hụrụ ya n'anya."" ""Ya mere o ji achọ ichekwa Kiddwaya oge ọbụla nke mere o ji dabaa na nsogbu."" Waya kwuru na ọ ga-amasị ya ma nwa ya nwoke bụ Kiddwaya lụọ Erica, mana ọ gaghị amanye ya amanye. Erica ekwuola okwu mbụ ya kamgbe ọ pụtachara n'ụlọ Big Brother Erica Nlewedim bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua maka etu Big Brother si chụpụ ya ụbọchị Sepụtemba 6,2020. Mana Erica apụtala n'onyonyo ọhụrụ na-efegharị n'elu soshal na-arịọ ụwa niile ma ndị ya na ya mekọrọ emume Big Brother mgbaghara. N'ime onyonyo ahụ bụ ụzọ pụta n'ọba ozi Big Brother Naija, Erica kwuru na ọ mụtala ka esi anọrọ onwe ya. Mmekọrịta ya na Kiddwaya Erica kwuru na o chere na Kiddwaya so na ihe kpatara Biggie ji ta ya ahụhụ mana o sikwa m aka makana mụ onwe sokwa mee ka e nye ya ntaramahụhụ. ""Ihe mere m ji hụ ya n'anya bụ na anyị abụọ na-eme ka ụmụaka, anyị na-eme ihe ọ bụla dị mma sọrọ anyị."" ""A ma m na ya bụ Kiddwaya echeghị etu ahụ maka m mana ọgbasaghị m."" Ihe tọkarịchara ya n'ụlọ ahụ Erica kwuru na obi tọrọ ya ụtọ nke ukwu mgbe abụọ e mere ya onyeisi ụlọ ahụ. Ọ na-atọkasị ya ahụ ma o merie egwuregwu imaka aka ha na-eme n'ụlọ ahụ. Oringo ha na-emekwa n'ụlọ ahụ na-enye ya obi ụtọ. Esemokwu ya na Laycon O kwuru na Laycon tụkwasịrị ya asị n'isi mgbe o kwuru na ya susuru ya ọnụ ụgboro ugboro mana nke ahụ okpotokpo asị Erica kwuru na agbanyeghị nke a, ọ kpọghị ya asị. Ihe ọ ga-eme ugbua ọ pụtarala n'ụlọ 'Big Brother' Erica kwuru na ọ ga-alaghachị n'ihe nkiri o na-emebu, ọ ga-achọkwa ịbụ onye nnọchite anya ọtụtụ ụlọọrụ na-emepụta ihe. Akpọrọ m Erica aha iji kuzie mgbaghara - Fada Mbaka Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministries Enugwu, akọwaala ihe mere o jiri kpọọ Erica Ngozi Nlewedim nke Big Brother Lockdown aha. Fada Mbaka onye kwuru dịka ọ na-ekwu okwu Chukwu n'ụlọụka na Erica mere ka nwa a na-azụghị azụ dịka ọ ji mkparị saa Laycon ahụ, kọwara na ọ bụ maka ikuzi maka mgbaghara ka o jiri kpọọ ya aha. O kwuru sị na ọ bụ okwu Chukwu metụtara mgbaghara, ndidi, ịhụnanya, ekpere nkwekọrịta na di na nwunye ịkpa nkata, ka ọ na-ekwu maka ya. O kwuru na ụfọdụ ndị arụrụala maburu naanị ebe ọ kpọrọ Erica aha, were na-ekwu okwu maka ya. Lee ihe ndị Adoration dere na Facebook maka ya: Erica eritela ihe karịrị naira '6 million' bụ ego atụkọtagoro ya ugbua Ndị hụrụ Erica n'anya amalitela ịtụkọrọ ya ego site n'ọba ozi "" gofundme."" Ka ọ dị ugbua atụkọtala ego ruru puku dọla iri na anọ maka nwada a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @biolakazeem na-akatọ etu ndị mmadụ si aghara itụkọrọ agụmakwụkwọ ego ma na-atụkọrọ Erica ego agbanyeghị ihe niile o mere na-amasịghị ndị mmadụ. @Demo__UK na-eti mkpu etu ntụkọta ego Erica na 'gofundme' si rịa elu n'erughị awa abụọ. Ụnyahụ bụ Sepụtemba 6 ka ndị na-ahazi emume Big Brother Naija nyere Erica Nlewedim ọsọ ụkwụ erughi ala maka agwa 'ọjọọ' ọ kpara n'ụlọ ha n'ụbọchị Satọde. Erica banyere na nsogbu mgbe Biggie tulechara ihe onyonyo etu o si gwa Laycon okwu mgbe ha abụọ nwere esemokwu. Ihe ndị ọzọ mere e ji nye ya ọsọ Ọ sị na Erica mebiri ngwa ụlọ ahụ mgbe o ji mmiri wụọ n'elu akwa osote onyeisi ụlọ ahụ na ọ gaghị anabata ụdị akparamagwa ahụ. Erica ji okwu ndị na-adịghị na-agba ụka na ntị na-akparị Laycon n'oge ahụ mana nwamadị a gbara ya nkịtị. Ọ bụ ihe ndị a na iwu ndị ọzọ Biggie si na ọ dara mere e ji nye ya ụdị ọsọ. Nke a ga-abụ ugboro abụọ a na-esi etu a achụpụ mmadụ n'ụlọ Big Brother Naija, mgbe a chụpụchara Tacha n'emume a nke afọ 2019. A chụpụla Lucy n'ụlọ Big Brother Naija Onye ọzọ e wepuru n'ọlụ Big Brother taa bụ Lucy mana ọ bụ si na ntuliaka e mere mmadụ isii a họpụtara maka ọpụpụ n'izu a bụ o nwetere vootu pekatachara na mpe. Lucy bụ onye nke iri na otu ga-esi n'ụlọ Big Brother pụọ kamgbe a malitere ya. Ugbua ọ fọrọ naanị mmadụ itoolu n'ime mmadụ iri abụọ batara n'ụlọ a mgbe emume a bidoro na 19 Julaị. Ihe Fada Mbaka kwuru maka agwa Erica kpara n'ụlọ Big Brother Naija Fada Ejike Mbaka nke 'Adoration Ministry' Enugwu etinyela ọnụ n'ihe mere n'ụlọ emume 'Big Brother Naija' n'abalị Satọde. Ọ katọrọ etu otu nwagbọghọ a kpọrọ Erica si were okwu ọjọọ saa otu nwaokoroọbịa bụ Laycon ahụ mgbe a gbasa ozi n'ụkọ ya n'ụbọchị Sọnde. Fada Mbaka sị na Erica kpara agwa dịka nwa a na-azụghị azụ, n'agbanyeghi arịrịọ ndị mmadụ na-arịọ ya, na ọ gara n'ihu na-akparị Laycon. Ọ sị ""Erica na mma niile ọ mara, egwu niile ọ na-ete, nye ya dịka nke iri, ya bụrụzie agụ na-adọri mmadụ"". Mbaka gara n'ihu sị n'ihi nke a na Erica nwereike ọ gaghị eji imi sie ego dị nde naịra iri asatọ na ise (N85m) ahụ bụ ego nrite n'emume a. O tokwara nwokoroọbịa maka ịkwanyere onwe ya ugwu n'ọnụ niile Erica kọrọ ya. Mana okwu Fada Mbaka a mere ndị mmadụ ji na-ajụ etu o si na-ekiri emume Big Brother, hapụ i lekwasị anya n'ọrụ ụkọchukwu ya. Erica arịọla mgbaghara maka okwu ọ gwara Laycon Ngozi Nlewedim e ji Erica mara n'ụlọ Big Brother arịọla mgbaghara maka okwu ọjọọ ọ gwakasiri ụfọdụ ndị otu ya nọ n'ụlọ ahụ, ọkachasị Laycon. Erica kwuru na ịrịọ mgbaghara so n'otu ihe rara ya ezigbo ahụ, mana ọ na-arịọ ka a gbaghara ya maka okwu iberibe ọ gwara ha. N'okwu ya, agaghị m ebo ya oke mmanya makana onye ọbụla ṅụrụ mmanya agaghị ekwu ụdiri ihe o kwuru. Nlewedim kwuru na o kwetere na ọ bụ iwe na ọnụma ọ kpadoro akpado mere ya ihe ahụ mana ọ ga-agba mbọ hụ na ọ dụrụ onwe ya ọdụ ka ọ ghara ime udiri ihe a ọzọ. Okwu butere ọrịọrịọ mgbaghara Kamgbe a malitere ụlọ Big Brother Naija Lockdown, Erica na Laycon so na ndị akpụ n'ọnụ maka ọtụtụ ihe si na mmekọrịta ha abụọ apụta. Nke na-ekpo ọkụ na soshal midia ugbua bụ etu Erica si were okwu ọjọ chọọ igwagbu Laycon n'abalị ụnyahụ. Gịnị na-esere ha ugbua? Onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi Erica ebe ọ nọ na-akpọ Laycon iyi makana o kwuru na o boro ya ebubo isusu ya ọnụ. Mana @SquareBea kwuru na ọ bụ onyonyo a na-egosi ebe Nengi na atakwunyere Kidwaya bụ ezigbote ọyị Erica ihe na ntị ya n'oringo ha mere n'abalị Sepụtemba 5 bụ ihe kpalitere iwe Erica. Ndị mmadụ nọ soshal midia na-ekwu na ha ga ahụ ka Biggie ọ ga-agwa Ebuka ka ọ manye ọnụ n'esemokwu a dapụtara n'etiti Erica na Laycon. @It_is_prestige depụtara ihe o chere ga-egbo nsogbu dapụtara n'ụlọ ahụ n'abalị ụnyahụ. Ihe ndị ọzọ Erica gwara Laycon Ndi okwu nhataha dịrị nwoke na nwaanyị tinyere ọnụ maka iyi Erica kpọrọ Laycon. Dịka Big Brother ga-abanye izụ ụka nke asatọ, ndị mmadụ nọ na-eche ka ha mara onye ga-apụ n'ụlọ ahụ. Etu Erica si buru onyeisi ụlọ Big Brother Lockdown nke ugboro abụọ Ngozi Nlewedim, onye a na-etu Erica eritala ọkwa onyeisi ụlọ n'ihe emume nke Big Brother nke ise dịka ọ merichara n'ihe ịmaaka e nyere ha. Erica họpụtara Prince ka ọ bụrụ osote ya nke pụtara na ha abụọ bụ akpaaka n'izu a. Nke a bụ ugboro abụọ ọ na-enwete ya bụ ọkwa dịka o nwetechere ya n'izuụka atọ n'ọnwa Ọgọstụ. Nke a pụtara na o nweghị onye ga-achụpụli ya n'ụlọ ahụ n'izu a, ma ọ ga-eritakwa ọtụtụ ihe onyinye ndị ọzọ so ya bụ ọkwa nke gụnyere ibi n'obi Eze e wepụtara maka ndị ji ya bụ ọkwa. O nwekwara ikike ịhọta onye ọzọ masịrị ya dịka osote ya bụ onye ya na ya ga-eso rịe uru dị na ya bụ ọkwa. O nweterekwara ọnọdụ dịka osote onyeisi mgbe Kiddwaya nwetere ọkwa onyeisi nke ụlọ Big Brother. Nke a mere ka Erica bụrụ onye nke abụọ ritegoro ọkwa a ugboro abụọ, ma e wezụga Ozo. Brighto, TolaniBaj na Wathoni akwarala ngwongwo ha laa Wathoni, Brighto na Tolanibaj Ihe nwere mbido ga-enwerịrị njedebe, otu a ka njem Brighto, Tolanibaj na Watoni n'emume Big Brother Naija nke afọ 2020 si bịa nisi njedebe. Nke a bụ nke mbụ a na-achụpụ mmadụ atọ n'ụlọ Big Brother Naija nke afọ 2020. TolaniBaj TolaniBaj Tolanibaj bụ onye nke asaa ebe Watoni bụ onye nke asatọ a na-achụpụ na egwuregwu BBNaija nke a. Ya bụ nwaada gbara afọ iri abụọ na asaa bụ onye Legọs steeti ma bụrụkwa onye ntaakụkọ. Ọ bụ ya bụ onye nke mbụ a chụpụrụ n'abalị Sọnde. TolaniBaj nwere oge Kiddwaya họọrọ ya dịka osote onyeisi ụlọ. Lee etu ndị mmadụ si eti ya aka n'obi na twitter: Kiddwaya sị na nchụpụ TolaniBaj n'ụlọ BBNaija wutere ya n'ụmị ọkpụkpụ Uti Nwachukwu kwuru na TolaniBaj nwere ọtụtụ ihe ọ ga-egosi ụwa ugbua ọ pụtarala na BBNaija. Watoni Watoni Wathoni bụ onye ọgba mbọ maọbụ nke Bekee na-akpọ 'Entrepreneur'. Ezigbo aha nwa ada a gbara afọ 29 bụ Florence Wathoni Anyansi. Ọ bụ ahịa ịkwa akwa na ire akwa ka ọ na-azụ, Bekee kpọrọ nke a 'fashion entrepreneur'. Wathoni ji otu nwa nwoke, ọ lụbeghi di, ọ na-asụ asụsụ Swahili nke ọma. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na Twitter: Noble Igwe kwuru na Wathoni ga-enweta ọtụtụ mmeri na ndụ ya. Monye jụrụ ihe kpatara e ji chụọ Wathoni ugbua ọ chọtara onye hụrụ ya n'anya n'ime ụlọ BBNaija. Brighto Ezigbo aha Brighto bụ Ezekiel Bright Osemudiame Nwa okorobịa gbara afọ 29 bụ onye ọrụ ụgbọmmiri. Ọ bụ onye Edo steeti ma bụrụkwa nwa nke ikpeazụ n'ime ụmụ isii nne na nna ya mụrụ. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum a kpọrọ 'Arab Academy for Science, Technology and Maritime Transport' nke dị na mba Egypt. Otu ihe e ji mara ya n'ime ụlọ BBNaija bụ na ihe gbasara nri olulo na-amasị ya nke ukwuu. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Ogbeni Dipo gwara Brighto ka ọ kpọtụrụ ya ka ha abụọ kpaa. Jag Ubani kwuru na eserese nri ọka na-amasị Brighto nke ọma. E nyela Praise ọsọ n'egwuregwu BBNaija Praise abụrụla onye nke isii ga-esi n'ụlọ Big Brother laa dịka ndị otu ya họpụtara ya. Ndị niile vootu ha kachasị dị ala kwesiri ịpụ na ya bụ ụlọ bụ Praise, Vee, Wathoni nakwa Trikytee. Lee mgbe akpọpụtara aha ya ebe a: Brighto bụzịkwa akara ọkụ n'ụlọ Big Brother Naija Ndị mmadụ kpụ Bright Ezekiel Osemudiame a.k.a Brighto so eme emume Big Brother n'ọnụ makana ha chere na ọ na-ebu ibu karịrị ya. Ụfọdụ na-echekwa na o si na agwa ụkọchukwu ọ na-egosibu n'ụlọ ahụ banye agwa ọzọ akpọrọ ""Lord Baelish."" Lord Baelish bụ otu agwa n'ihe nkiri ndị bekee na-eji uche ndị mmadụ anụ garrị. @_valkvolxz kwuru na mgbe mbụ ihe ngosi ahụ malitere, ọ bịa dịka Biggie echezọrọ Brighto mana mgbe ahụ ka ya bidoro nyochawa ya bụ nwa amadi. @itschigbo kwuru na etu Britho si eji uche eso ụmụ nwaanyị nọ na Big Brother Naịja Lockdown na-amasị ya. @mabelkeri na-eto agwa Brighto na-akpa n'ihe nkiri Big Brother Naija Lockdown. @xeezii kwuru na etu Brighto si buru achịcha ọkụ n'ụlọ Big brother bụ ihe tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya. Cheta na mgbe emume a bidochara , na ndị mmadụ wepụtara akwụkwọ gosiri ebe Brighto na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ ga-aekwu okwu n'emume ụka mana nwa amadị a pụtakwara ozigbo kwuo na ya bụ akwụkwọ bụ adịgboroja n'ihi na ọ bụghị ụkọchukwu. @MichaelOdumeny1 na-eche na Brighto ga-agwa Biggie na ndị ọ chọrọ ka ewepụ n'ụlọ taa bụ ụbọchị mwepụ bụ Wathoni na Dorathy makana ha na-enye ya nsogbu. Achụpụla Kaiysha n'ụlọ Big Brother Achụpụla Kaisha Umaru n'emume Big Brother Naija nke afọ 2020. Kaisha bụ onye nke ise a na-achụpụ na ya bụ asọmpi. Ọ bụ ndị nọ n'ụlọ Big Brother Naija mere ntuliaka were họpụta ya. Cheta na onye meriri ga-eji nde naira iri asatọ na ise na-elele ndị ọzọ. Lee ihe ọzọ na-ewu maka Big Brother Naija Lockdown Kiddwaya so eme Big Brother Lockdown amụnyela soshal midia ọkụ. N'oringo a na-eche na ha mere n'abalị ụnyaahụ bụ ụbọchị iri na ise nke ọnwa Ọgọstụ, ka onyonyo setere ya ebe ọ na-agba egwu. @mister_vaughan_ kwuru na amaghị agba egwu ka eji ama onye ga-enwe ezigbo ego. Ndị mmadụ malitere kwuwe na egwu ọ gbara n'emume ahụ agaghị azọtali ndụ makana ọ maghị agba egwu. Oni nke Ife ekwuola ka agbanwee ihe ngosi a: Ooni na-achị Ife bụ Enitan Ogunwusi ekwuola ka agbanwee ihe ngosi 'Big Brother' ma were nke a kpọrọ "" Big Nigeria Reality Show' nke ga-ana-egosi[pụta ezi ụkpụrụ e ji mara ndị Naijiria. Ogunwusi sị na Big Brother anaghị egosi nkwenye nakwa ezi agwa eji mara ndị Naijiria. O kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara dịka e mere ncheta ụbọchị ndị ntorọbịa n'ụbọchị Wenzde. N'uche ya ndị ntorọbịa oge a anaghị etinye anya n'ihe gbasara ọchịchị mana ha jisike arọ nrọ ka Naịjrịa gbanwee. N'ọnụ ya ""Na ntụliaka gara aga naanị mmadụ nde 27 tụrụ vootu ebe ihe ruru nde 170 tụrụ vootu na ntụliaka nhọpụta Big Brother nke afọ ahụ"" O kwuru ka ndị ntoroọbịa gbanwee echiche ha malite ịche maka ọchịchị na etu ha ga-esi soro n'ihe a na-eme maka ọdịnịhụ Naịjirịa. E nyela Tochi na Eric ọsọ n'ụlọ Big Brother Naija Lockdown E nyela Tochi na Eric ọsọ n'ụlọ Big Brother Naija nke agba ise. Nke a na-abịa dịka ha dabanyere n'ime mmadụ anọ ikpeazụ ndị ọnụọgụgụ e ji tụnyere ha vootu agbaliteghi elu n'izu a. Eric, Tochi, Kaisha na Trikytee bụ mmadụ anọ aha ha banyere n'anọ ikpeazụ, tupu a chụpụ abụọ n'ime ha. Tochi na Eric esonyela Ka3na na Lilo bụ ndị a chụpụrụ n'izu gara aga. Ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ gbasara ya Ndị mmadụ na-akpọ Ebuka aha dịka ha sị na ọ na-akpọ okwu aha gbasara ihe niile mere n'ime ụlọ ọkachasị ihe gbasara mmekọrịta Kiddwaya na Erica. Ha kwukwara na o ji aghụghọ dụọ Laycon ọdụ maka ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya n'etiti mmadụ abụọ ahụ. Lee ihe Erica sara mgbe Ebuka jụrụ ya: Onye ka a ga-achụpụ n'ụlọ Big Brother? Ndị nso nso Big Brother ga-amata onye ga-apụ taa bụ ụbọchị itoolu nke Ọgọstụ kamgbe Ka3na na Lilo na mbido izu ụka a. N'ụbọchị tọzde gara aga ka enyere ndị nso nso ohere ruo elekere iri nke abali ka ha were tunyere onye nke ha ha chọrọ ka ọ kanọrọ n'emume a vootu ha. Ndị so eme emume Big Brother anọọla abali iri abụọ na otu n'ime abali iri asaa na otu ha nere inọ n'ụlọ ahụ. Ihe ise ị kwesiri ịma maka nchụpụ a ga-eme taa Mmadụ iri na isii so na ndị enwereike iwepụ taa n'ime mmadụ iri na asatọ, ma e wepụ Ozo na Dorathy bụ isi na osote isi ụlọ Big Brother. Lee ha: Victoria Adeyele a ma dịka Vee Timmy Sinclair a ma dịka Trikytee Terseer a ma dịka Kiddwaya Praise Nelson Florence Wathoni Anyansi Tochukwu Okechukwu a ma dịka Tochi Eric Akhigbe Erica Ngozi Nlewedim Ezekiel Bright Osemudiame a ma dịka Brighto Aisha Umaru a ma dịka Kaisha Emuobonuvie Akpofure a ma dịka Neo Tolani Shobajo a ma dịka Tolanibaj Olamilekan Agbeleshe a ma dịka Laycon Rebecca Hampson a ma dịka Nengi Lucy Essien Ka mwepụ taa ga-esi gaa Otu onye ga-apụ n'ime mmadụ iri isii akpọkpụtara nwereike ịpụ n'ụlọ Big Brother taa, ndị nọ n'ụlọ ahụ ga-enwekwa ikike ịtụ onye ahụ aka. A ga-enye ndị niile nọ n'ụlọ Big Brother ohere ka ha họpụta otu onye n'ime ndị vootu ha pekarịchara na mpe ga-apụ n'ụlọ ahụ taa. Onye ha ka tụnyere vootu maka ọpụpụ n'ime mmadụ anọ a ga-apụ. Nke a bụ mbụ ndị hibere ọgbakọ a na-eme udiri ihe a. Mgbe Erica, Kiddwaya na Laycon mere ka soshal midia nwuru ọkụ Ndị mmadụ na-egosi mmasị ha n'elu soshal midia maka etu ọyị Nengi na Ozo si aga n'emume 'Big Brother Naija Lockdown'. Ụfọdụ n'ime ha na-eche na Nengi chọrọ ka ya na ụmụnwoke niile nọ n'ime ụlọ Big Brother na-adị na mma mana onweghị onye ọ chọrọ ka ya na ya nwe mmekọrịta. Erica agwala Laycon obi ya Ọ dịkwazi ka ọ bụ Erica bụ nwaanyị ka chaba ụmụ Naịjirịa n'anya n'emume Big Brother Lockdown. O wuwere na soshal midia n'ụtụtụ a maka etu o si gwa Laycon na ọ hụrụ ya n'anya maka etu uburu ya si acha ọkụ mana onye ọ ka adabakarị ya na ya bụ Kiddwaya. Nke a tituru mmụọ Laycon mere ka ndị mmadụ malite ikwu maka Erica na Laycon n'elu soshal midia. Lee ụfọdụ ihe ha deputara; @peter_agama depụtara nkata ahụ ha kpara ma dụọ Laycon ọdụ ya gbado anya na ihen ọ bịara inweta na Big Borther Lockdown. @thesocialcrib na-ekpe ekpere ka Laycon chezọ maka Erica ruo afọ 600. @iam_Barack na-arịọ Laycon ka ọ hapụ Kid naErica ga n'ihu n'ihụnanya adịgboroja ha. Ozo abụrụla nwoke mbụ ga-achịkọta ụlọ Big Brother Season 5, Dorathy ga-enyere ya aka N'ihi mmeri o meriri n'asọmpi a kpọrọ ""Head of House challenge"", Ozoemena e ji Ozo mara abụrụla nwoke mbụ ga-achịkọta ụlọ Big Brother nke agba ise. Ozo na Dorathy bụ onye ọ họpụtara ka o nyere ya aka, ga-anọ n'oche ahụ otu izu. Ha nọchiri Nengi (na Wathoni) na Lucy (na Prince) chịrị n'izu nke mbụ na nke abụọ ha batara n'ụlọ ahụ. N'ihi mmeri a, Ozo agaghị anọ n'oche dị ọkụ mgbe ndị otu ya mmadụ 16 ndị ọzọ ga-azọ isi onwe ha ịhụ na a chụpụghị ha n'ụlọ. Ihe mere Kidwaya na Erica na-ewu Ka e mechara emume nkwapụ na Big Brother ụbọchị abụọ nke Ọgọstụ bụ Sonde, ka ụmụ Naịjirịa setere ihe nkiri ebe Erica na Kidwaya na-apịrịtụ onwe ha. Ihe ha mere atụchaghị ndị nso nso ha n'anya makana ha abụọ ekwubuola na ha hụrụ onwe ha n'anya nke ukwu ma na-esusukarị ọnụ mgbe ọbụla. Ndị nso nso ha abala ha 'kiddricca.' Onye ka Erica bụ? Ngozi Nlewedim bụ onye na-eme ihe nkiri dị afọ iri na isii. Ọ gụrụ akwụkwọ na Met Film School dị na London. O kwuru na ọ chọrọ ibu onye ama ama. Igba egwu n'ihu ugegbe na-amasị ya nke ukwu. Ndị ọzọ na-eme mpịrịtụ na Big Brother Lockdown a. Praise na Katrina Ihe nkiri aramara Praise na Katrịna gbagọjụrụ ụwa anya makana onweghị onye hụtara na abụọ na-ayị ọyị. Ihe ndị ọzọ nọ na-ekwu n'elu soshal midia Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu soshal midia na-akatọ Erica so eme emume Big Brother makana ha si na ha aghọtaghị ihe ya na Kiddwaya so emekwa Big Brother na-eme n'okpuru akwa ndịna n'abalị. Ụfọdụ si na etu ya na nwoke ahụ si dịnaa n'elu akwa na-eme ihe sọrọ ha adịghị mma, ebe ụfọdụ kwuru na ha ga-akwado Erica site n'ịtụrụ ya vootu agbanyeghị ihe ha chee na o mere. @Vivi89163601 si na agabanyeghị na Erica tere onwe ya ule n'onyonyo na ọ ka ga-akwado ya site n'itunyere ya vootu. @kween__Lisa kwukwara na ọ ga-akwado Erica Mide kwuru na obi adịghị ya mma maka etu Erica si hapụ onwe ya aka na-eme ihe sọrọ ha. Etu esi chụọ Ka3na na Lilo n'ụlọ Big Brother A họpụtara mmadụ iri na asatọ n'ime mmadụ iri abụọ nọ n'ụlo a. Kama emechara wetuo ya ka ọ bụrụ mmadụ anọ bụ Praise, Ka3na, lilo na Eric . Ọ dịrị mmadụ ndị nọ n'ụlọ ka ha họpụta ndị ha chọrọ n'ime mmadụ anọ a ka ha laa. Lee etu ha ụfọdụ n'ime ha sịrị họọ ndị ha chọrọ ka ha pụọ Brighto họpụtara - Eric na Ka3na Nengi họpụtara - Ka3na na Praise Kama ọ bụ Ka3na na Lilo bu ndị ha họpụtara ka ha pụọ. Ụfọdụ ndị na-eme emume Big Brother nke agba ise nwereike kwakọrọ lawa taa bụ ụbọchị Sunday, Ọgọstụ abụọ. N'izu ụka a, mmadụ ruru iri na asatọ tozuru ipụ n'ụlọ ahụ dịka 'Biggie' kwuputara atụmaatụ ọhụrụ a ga-eji mee ya bụ ihe nkiri. Akwụsịla itụ vootu nye ndị ahụ echere ga-apụ n'izu ụka n'emume 'Big Brother Lockdown.' Ọ bụ naanị onyeisi ụlọ ahụ bụ Lucy nakwa osote ya bụ Prince ka apịpịa ọpụpụ agaghị emetụta. Ndị ọzọ a na-eche nwereike ipụ bụ: Ozoemena Chukwu a na-kpọ Ozo Victoria Adeyele a na-kpọ Vee Boluwatife Aderogba a na-kpọ Lilo Timmy Sinclair a na-kpọ Trikytee Terseer Kiddwaya Dorathy Bachor Praise Nelson Florence Wathoni Anyansi Tochukwu Okechukwu a na-kpọ Tochi Kate Jones a na-kpọ Ka3na Eric Akhigbe Ngozi Nlewedim a na-kpọ Erica Ezekiel Bright Osemudiame a na-kpọ Brighto Aisha Umaru a na-kpọ Kaisha Emuobonuvie Akpofure a na-kpọ Neo Tolani Shobajo a na-kpọ Tolanibaj Olamilekan Agbeleshe a na-kpọ Laycon Rebecca Hampson a na-kpọ Nengi Onye nwere vootu pekarịchara na mpe bụ onye a ga-akwapụ n'emume a. Nengi, Dora, Tolanibaj e mere nke tọrọ Biati ụnyaahụ bụ Ọgọstụ 1? Kamgbe Big Brother Naijiria nke ugboro ise malitere, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-aga na soshal midia ekwupute ihe tụrụ ha n'anya gbasara ụbọchị ọbụla gaferenu n'ụlọ ebe a na-eme ya bụ ihe nkiri. Nke mbụ ha manyere ọnụ na ya ụnyaahụ bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ, bụ ihe ha hụrụ Tolanibaj so eme BBNaija na-eme n'okpuru akwa mkpuchi ahụ ya. Ọtụtụ n'ime ha sị na ha chere na ọ na-apịrịtụ onwe ya aka. Sọ ha ma ihe ha hụrụ mana lee ihe ha kwuru maka ya n'elu soshal midia: @TWEETORACLE na-ajụ ma Tolanibaj a na-apịrịtụ onwe ya aka? @holatunboshift na-ekwusi ike na Tolanibaj nyere onwe ya aka ebe ọ bụ na onweghi nwoke bịara ya n'akụkụ. Nengi o kotere onwe ya ebu akpọmasị? Ndị mmadụ na-ajụ ihe kpatara ụmụnwaanyị ndị ọzọ so eme emume Bigb Brother ji ekwo Nengi sokwa eme emume Big Brother ekworo, @zayn_narb si na ọ bụ maka mma Nengi mere ha ji ekwo ya ekworo. Mana ụfọdụ kwuru na Nengi ji aka ya butere onwe ya akpọmasị. @adeyossy_a kwuru na mgbe mmadụ iri na itoolu ya na ha nọ n'ụlọ na-ekwu maka ihe ọjọ ọ na-eme , na nke a gosiri na Nengi nwere nsogbu. Dora a na-ewere Nengi iwe? Ndị mmadụ na-eche na Dora na-ewere Nengi iwe maka otu nwoke akpọrọ Ozo Sokwa eme emume big Brother . @dami_larey na-eche na Dora na-ewe iwe na Nengi zuru ụtọ bi ya bụ Ozo. @Bubbles30631081 chee na okwu esighị n'aka Ozo makana o were Dora ka ezigbo ọyị ya. @zee_okoli ekweteghị na ọ bụ maka nwoke ka Dora ji eburu Nengi ihu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44135619,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135619,Akụkọ kachasị taa: Nọt Koria chọrọ ịgbaha ọgbakọ ha na Amerịka,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Ụlọịkpe pụrụịche na-ahazi ka onye si-eme n'ọrụ gọọmentị bụ Code of Conduct Tribula na bekee, ekwuola na o nweghị ihe Jostis Sylvester Ngwuta mere. Nke a bụ maka okwu gbasara ekwupútaghị akụ na ụba ya ha n'ezie. End of Twitter post, 1 Ebe ọzọ na Naịjirịa... Gọọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ijeri naira 10 na idozi Benue steeti na steeti ndị ọzọ ndị ọchịehi mebiri ihe. Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu Ọkammụta Yemi Osinbajo bụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru nke a ebe ọ gara nleta iti aka n'obi na Benue steeti. N'otu aka ahụ, akpụpụla onye ndu ndị Shiites n'ụlọịkpe ịzara ọnụ ya maka ebubo ịbute ọgbaaghara n'obodo. Cheta na e jichiri ya na nga kemgbe afọ 2015. Akụkọ ofesi Onyeisiala mba Nọt Koria na-ekwu na ha nwere ike ị gbahịị nzụkọ ga-adị n'etiti ha na mba Amerịka ma ọ bụrụ na Amerịka jisike na-akwanye ha ọkụ n'ike maka ngwa agha nụklịa ha. Kim Jong-un na Donald Trump kwesiri ị zuko n'ụbọchị 12 nke Jun n'obodo Singapore ị kpa maka odinihu mba ha abụọ. N'Egwuregwu, Ebe niile kwuru jim n'ọgbọ egwuregwu villa park ụnyaahụ Nke a bụ iji kwanyere onye ọgba bọọlụ ọchie otu Aston Villa Jlloyd Samuel nwụrụ na mberede okporoụzọ. Gee ya nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ." afirika-46670791,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46670791,Benjamin Netanyahu ọ ga-achị Israel nke ugboro ise?,"Akụkọ dị mkpa taa: N'ofesi,","Ndị mba Izrel ekwuola na ha ga-eme ntuliaka n'ime ọnwa Epreelụ na-abịa, ebe Benjamin Netanyahu bụ onyeisiala ha na-ele anya ịbụ onyeisiala nke ugboro ise. Benjamin Netanyahu Ọ bụrụ na Netanyahu merie ntuliaka a, ọ ga-abụ onyeisiala kacha chịa mba Izrel. Gịnị na-afịọ n'Anambara? Haruna Mohammed bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara, gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ha adịghị aza oku ma a tọrọ mmadụ makana ọ bụ ọrụ ha ịhụ na obodo nwere nchekwa. Mohammed kwuru okwu a, ka ụfọdụ ụlọntaakụkọ dere na ndị mmadụ n'Umunze, sị na ntọrị na-eme na be ha adịghị enweta enyemaka, dịka o kwesịrị, n'aka ndị uweojii. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọ bụghi eziokwu na anyị adịghị aza oku ndị Umunze - Uweojii Ngagharịiwe na Zamfara Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ. Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu ""anyị achọghị"". Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọgbaghara adaala na Zamfara N'egwuregwu, Kedụ ndị na-akwado Arsenal ebe a? Onye egwu bụ Henrikh Mkhitaryan, apụọla n'egwu site n'ụkwụ ọ gbajiri. Mkhitaryan esonyela Danny Welbeck na ndị Arsenal merụrụ ahụ na-agaghị agba bọọlụ n'oge dị anya Ndị Arsenal kwuru na ọ gaghị agba bọolụ n'ime izu isii, ruo mgbe ọ ga-agbake. ""Depụta ihe niile ị mere mgbe ị bụ gọvanọ"" Onye kwuru nke a. Ọ bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo sara onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole dịka ha na-ama aka. Cheta na Oshiomhole katọrọ Rochas Okorocha na mmalite ịchụnta vootu Hope Uzodinma n'Owere. Ọzọ, Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ụmụ mmadụ ataala onyeisiala Buhari ụta, ụfọdụ kpọrọ oku ka akwụsị abụbọọrụ ahụ ebe ndị ọzọ ekwuola na ha ga achọ ọrụ ọzọ dịka otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum akpọrọ ASUU n'aha ịchafụ kwudosi ike na abụbọọrụ ha ga-aga n'ihu. Na mba ofesi, Dịka ala ọmajiji mechara na mba Indonesia, ndịọrụ gbatagbata adọọla ndị biketere mmiri nso ha kwapu n'akụkụ mmiri n'ihi na ibibia mmiri nwereike ịme ọzọ. Cheta na mmadụ karịrị narị abụọ anwụọla mbụ n'ihe mberede a. N'egwurewgu, Thiago Silva abanyela n'ọnụọgụgụ ndị ọgba bọọlụ otu PSG ndị ohi gbakara ụzọ ya mgbe ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu. Ndị uweojii kwuru na ọnụ ihe ezuru na bee ya ruru puku euros ole na ole. Gee Nkeji nke ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50510164,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50510164,Dan Anyiam: Gịnị ka ị ma maka dimkpa Igbo a?,Gịnị ka ị ma maka Daniel Amobi Amadi Anyiam?,"Ọ bụrụ na ị na-ele egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa, e nwereike ị nụtụla mgbe a gbara bọọlụ n'ọgbọegwuregwu a kpọrọ ""Dan Anyiam Stadium"". Mana ị ma onye nwoke a bụ? Ngwa gbado anya n'akụkọ a ka ị chọpụta. Ihe ị kwesịrị ịma maka Dan Anyiam Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-53543333,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53543333,Hydroxychlorine and Zithromax: 'Stella Immanuel esoghi usoro e ji ekwupụta maka ọgwụgwọ ọrịa' - Ndị Dọkịta Naijirịa,Ndị dọkịta Naijirịa ekwuola uche ha maka okwu Stella Immanuel kwuru ebe ọ sị na o ji ọgwụ Hydroxychloroquine agwọ ma na-egbochi ọrịa coronavirus.,"Ndị tinyere ọnụ n'okwu a bụ ndị okammụta n'ihe gbasara nje na-ebute ọrịa na ahụike ọha mmadụ. Okammụta Bayo Onajole Dọkịta Bayo Onajole bụ ọkammụta ahụike ọha n'ihe gbasara etu nje sị amụbanye n'ọha mmadụ nke Bekee kpọrọ Epidermiologist. Onajole kọwara na ọrịa coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ a na-ahụbeghi mbụ. Ọ kọwara na ụfọdụ ndị apụtala kwuo na ha jiri ọgwụ di iche iche gwọọ ọrịa coronavirus. Onajole kwuru na otu n'ime ọgwụ Immanuel kpọpụtara bụ ọgwu eji agwọ ọrịa nje Bacteria kama coronavirus bụ ọrịa nje Virus na-ebute. Covid 19 n'otu nkeji: 'Dogoyaro' o nwereike ịgwọta coronavirus O kwuru na e kwesiri ime nyocha nke ọma, lee ọnụọgụgụ anya iji mara nke bụ eziokwu. Onajole kwuru na Immanuel kwesiri iso usoro kwesiri ekwesi ma mee nyocha etu o kwesiri nke a na-akpọ Scientific Peer Review n'okwu bekee tupu ọ pụta kwuo okwu ọbụla. Ọ rụtụkwara aka n'etu Immanuel si kwuo okwu mere ka ọ dịka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Dọkịta Ezekiel Oridota Dọkịta Ezekiel bụ onyeisi ndị ọrụ ahụike na-aluso ọrịa covid-19 ọgụ na Legọs steetị. Ọ bụ kwa ọkammụta n'ihe gbasra ahụike ọha na etu nje si amụbanye na mahadum ụlọọgwụ nke legọs steeti. Ọ Kọwara na e nwere usoro tupu mmadụ ekwuo na ọ chọpụtala etu e si agwọ ọrịa. Oridota kwuru na ocheghị na Immanuel mere nyocha dịka etu ndị sayensi si eme ya. Ọ kọwara na ọ bụ ihe ọ hụtara n'ihu ọrụ ya ka o jiri kwuo ihe o kwuru. Dkt Oridota kwuru na ha na-eme nyocha nke ha n'ụzọ ziri ezi Akpụkpọ ụkwụ ọ na-ebu coronavirus Oridota kwuru na ha na-eme nyocha na LUTH ma n'ime izuụka ole na ole na ndị mmadụ ga-ahụta mpụta nyocha ha. Ọ rịọkwara ka ndi mmadụ mee ihe niile gọọmentị si ha mee maka nchekwa ọrịa coronavirus. Dọkịta Ore Makinde Dọkịta ore Makinde bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike ezinụlọ. Makinde kwuru na ọ nabataghị etu Stella Immanuel si kwupụta ihe ọ chọpụtara. Ọ kọwara na Immanuel kwesiri iwepụta ihe ọ chọpụtara ma gosi kwa ọnụọgụgụ etu ziri ezi. Makinde sị na e kwesiri itule ma nyocha ihe Immanuel kwuru site n'usoro bekee na-akpọ ""Peer Review"" tupu o kwuputa ya. Ebe Donald Trump kwụ Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump akwadola ọzọ ka e jiri ọgwụ hydroxychloroquine were buso coronavirus agha. O kwuru ya ka onyonyo ebe dọkịta onyeisi oji bụ Stella Immanuel na-ekwu maka etu Hydroxycloroquine si gwọta ndị ọ na-elekọta bu ọrịa coronavirus fegharịchara n'elu intanet. Trump sị na ihe mere ndị ọrụ ahụike ya ji jụ ịnabata ọgwụ a e ji agwọ ọrịa ịba bụ maka na ọ bụ ya wepụtara atụmatụ a. O kwuru na Twitter machiri ọkpara ya nke nnukwu tinyere onyonyo ahụ ma na-akwado hydroxychloroquine. Trump kwuputere ihe ndị a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ""White House"" ebe onye ntaakụkọ jụrụ ya maka ihe nkiri ahụ. Trump kwuru na o nweghị ihe ọbụla ọ ma maka nwaanyị ahụ ma gawara onwe ya. Mana Trump toro ihe onyonyo nwaanyị ahụ mere n'elu twitter ya mgbe ọ pụtachara. Ihe ndị ị na-amaghị maka Stella Immanuel kwuputere maka ọgwụgwọ covid-19 Ndị mmadụ chọrọ imata maka nwada Stella Immanuel, onye Facebook, Twitter nakwa ụlọọrụ soshal midia ndị ọzọ dọtụrụ onyonyo ebe o na-ekwupute maka ọgwụ nwereike ịgwọ covid-19. Ha na-ajụkwa ihe mere o ji kwupute maka hydroxychloroquine nakwa ndị ya kwụ mgbe o na-eme nkwupute ahụ. Cheta na WHO kwuru na ọgwụ ahụ anaghị agwọta ndị na-arịa coronavirus. Mana BBC hụrụ onyonyo ọzọ dịka agba abụọ nke nkwupute Immanuel. Onyonyo ahụ gosiri dọkịta dị iche iche nakwa dọkịta Immmanuel kọwara onwe ya dịka ụkọchukwu nakwa 'onye agha nke chukwu.' N'okwu ya, ""ọgwụ a karịrị ndị wenitere isi na Amerịka, ndị democrats na republicans,. ọ bụ amansi a ga-ejili naanị agha ime mmụọ wee merie."" ""Ndị kwadoro ọrịa ebughị ọdịmma mmadụ ibe ha n'obi."" Ihe ndị ikwesiri ịma maka Stella Immanuel N'ime Onyonyo ka dịnụ mgbe e dere akụkọ a, Immanuel kwuputere na ọ bụ onye Cameroon , nwetere ọzụzụ maka ahụike na Naịjirịa. ọ batara na mba Ameịka n'afọ 1992. o kwukwara na ọ nọla ebe ahụ ruo afọ iri atọ. Hydroxychroloquine na Zithromax dọkịta a kpọpụtara a na-agwọ coronavirus? Ụwa na-ekwu n'elu soshal midia maka Dọkita Stella Immanuel nọ mba Amerịka maka etu o si kwuo n'onyonyo na-efegharị ka o si jiri ọgwụ Hydroxychroloquine nakwa Zithromax gwọta mmadụ 350 na-arịa ọrịa coronavirus. O kwuru na o ji ya bụ ọgwụ e chekwa ndị ọrụ ya iji gbochie ha ibute coronavirus. Stella kwuru na ndị o ji ọgwụ ndị a gwọta gụnyere ndị bu ọrịa shuga, asthma nakwa ndị kalara nka. O gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị mmadụ welitere isi n'Amerịka na-aṅụ ọgwụ ndị a mana ha achọghị ka ụmụ ụwa mata maka ya. O kwuru na ọ bụrụ na ha ma na ha anaghị aṅụ ọgwụ ndị a, ha ṅyụta mammiri ha ka o mee ya nnyocha ka eziokwu gbaa. Mana Hydroxychroloquine nakwa Zithromax a na-agwọ Covid-19? Sam Ohuabunwa bụ ọkachamara n'ihe gbasara ọgwụ ma bụrụkwa onyeisi otu jikọrọ ndị na-akụ ọgwụ a kpọrọ 'Pharmaceutical Society of Nigeria' kwuru na ọgwụ abụọ ndị dịcha mma n'onwe ha. Mana tupu onye dịka dọkịta Immanuel pụta gwa ndị mmadụ ha nwụwa ya maka ọgwụgwọ Covid-19, na o kwesiri iji usoro e si eme ya na ngalaba ahụike. Usoro ahụ gụnyere, Immanuel idepụta ihe ndị ọ chọpụtara ma kwe ka ndị ọkammụta tinye ya anya, nwalee ma mara ka ya bụ ọgwụ si agwọ ihe ọ sị na ọ na-agwọ. Ohuabunwa kwuru na ọ bụghị onye ọbụla ka ọgwụ ndị a na-enyere aka. O kwuru na nnyocha ndị sayensi mere gosiri na ndị ọgwụ ndị a na-emeru ahụ karịrị ndị o na-enyere aka maka na ahụ dị iche iche. O kwuru na o nwere ndị na-agaghị aṅụ ọgwụ ma gbakee n'ọrịa coronavirus, nwekwa ndị ahụ ha ga-anabata kịrịkịrị ọgwụ ga-eme ka ha agbakee ha, nwekwarị ndị ọnọdụ ha maka covid-19 ga-akawanye njọ. Ihe na-eme na soshal midia maka nkwupute Stella Immanuel Facebook, Persicope nakwa ụlọọrụ soshal midia dị iche iche dọtụru onyonyo ahụ ebe Immanuel na-ekwu maka etu hydroxychloroquine, zinc si gwọta ndị na-arịa coronavirus na mba Amerịka. Ha dọtụrụ ya bụ onyonyo ka ndị mmadụ kirichara ya ruo nde iri na anọ dịka onyeisiala Donald Trump kesara onyonyo nke Periscope tinyere n'elu twitter ya. Ihe mere Facebook ji dọtụọ ihe nkiri Immanuel Ọnye na-ahụ maka nhazi atụmaatụ ụlọrụ Facebook bụ Andy Stone kwuru na ha wepụrụ ya maka na ọ bụ nkesa akụkọ ụgha maka ọgwụgwọ covid-19. Ihe WHO na-ekwu maka ọgwụ ndị a? World Health Organization depụtara na webụsaiti ha n'ụbọchị anọ nke Jụlai na jka ha mechara nyocha hydroxychloroquine and lopinavir/ritonavir , ịmata ma ha na-agwọ covid-19, ha chọpụtara na ọ naghị egbochi ndị mmadụ isi n'ọrịa covi19 nwụ. Onye bụdị dọkịta Stella Immanuel? Dọkịta Stella Immanuel bụ onye ọrụ ahụike na Houston Texas,. Ọ na-arụ na Rehoboth medical centre dị n'obodo ahụ. O kwuru na o nwetara ọzụzụ dịka dịbia bekee na Naijirịa mana o kwughị ụlọakwụkwo ebe o nwetara ọzụzụ a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @NicoleKathryn3 toro etu dọkịta a si na-agwa ndị wenitere isi n'Amerịka ha nyụta mamiri ha ka e nyocha ma ha si na ha anaghị aṅụ ọgwụ ndị a. Kemi Ariyo na-etokwa ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-46983859,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46983859,Child Trafficking: 'Mgbe a gwara m na m bụ nje HIV ekwetaghị m',"N'ala Naịjirịa taa, e nwere ọnụọgụgụ ndị nọ n'ohu ọgbaraọhụrụ n'Afrịka niile.",Otu onye ọrụ BBC bụ Kunle Falayi mere nyocha gbasara otu nwa agbọghọbịa esi n'ime obodo Uko Ita n'Akwa Ibom gba mgbere rue Legọs. GEE NTỊ: Ụfọdụ ihe ị ga-ahụ n'ime ihe onyonyo a nwereike ịnye gị nsogbu. Onye rụrụ ya: Kunle Falayi. Ihe onyonyo: Chukwuemeka Anyikwa na Dan Ikpoyi. afirika-43604141,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43604141,Mmerụaka: PDP na APC na-akwata,"Otu PDP ekwuola n'aha Gọọmenti etiti nke APC nọ n'isi ya wepụtala dịka ndị ha na-ebo ebubo na ha zuru ego Naijiria n'oge ọchịchị PDP bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọm, n'ihi na e nwere ọtụ ndị nọ n'ọchịchị APC eborola ebubọ mmerụaka aka.","Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017 N'ụbọchị Fraidee, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ, Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmenti etiti na-ebo ebubo na ha zụrụ ego ala Naijiria n'oge ọchịchị PDP. Aha ndị ọ gụnyere bụ onyeisioche otu PDP bụ, Prince Uche Secondus(N200m); onye nwe ụlọọrụ Daar Communications bụ Raymond Dokpesi(N2.1 billion), na onye bụ odeeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Olisa Metuh(N1.4bn), onye bụbu onye enyemaka ukwu Goodluck Jonathan, bụ Dudafa Waripamo-Owei(N830 million). Mana ọsịsa ha, otu PDP site n'ọnụ odeeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ, Kola Ologbondiyan, sị na otu APC ịtụ ndị otu ha aka na ha buru ego bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọm.' N'akwụkwọ ozi ha, otu PDP gụpụtara ndị nọ n'ọchịchị Muhammadu Buhari eborola ebubo mmerụaka ndị PDP kwuru na ha kpobara ebubo ahụ ọhịa. ""Nke a bụ gọọmenti akọwanwughị maka $26 billion (N9 trillion) ezuru na ọrụ ngo NNPC, mmanụ agbịdị dara N1.1 trillion nke e jiri tọọ mkpa APC, N18 billion ego ehiwere maka ndị nọ ebe ndị ọ gbara ọsọ ndụ a na-akpọ IDP nke ha boro ebubo na ndị APC, gụnyere odeeakwụkwọ gọọmenti etiti,Babachir Lawal, zuru. Lai Mohammed kwuru na e wepụta aha ndị ahụ bụ iji zaa oku ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ ka agba aha ha n'anwụ PDP sị: ""Ijeri naira iri, ego ehiwere maka ahụike nke a kpọrọ NHIS n'afa ịchafụ nke aka na-arụ ụfọdụ ndị otu imeezi Buhari ndị a na-akpọ 'cabal' na bekee, nakwa, 'Mainagate', ebe gọọmenti APC kpọchịgha ma nyeghachi n'ọrụ onye ahụ onye a tụrụ aka na o mere mpụ a rụrụ ijeri kwuru ijeri."" PDP mara Lai Mohammed aka ya kpọpụta aha ndị pati ha ndị amarala ikpe maka ibu ego. ""Aha nke a gọọmentị etiti wepụtara dịka ndị buru ego bụ imechu aha erijughị afọ n'ihi na onweghị ndị a mara ikpe n'ụlọikpe maọbụ otu nyocha n'ala Naijiria."" PDP gara n'ihu kwuo n'aha ahụ edepụtara bụ gọọmenti etiti iga n'ihu na ị ma ndị otu ha ikpe n'ime akwụkwọ ntaakụkọ, ma mara ha aka iwepụta aha ndị otu ha amaraikpe n'ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50225826,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50225826,"Ọgba Mbọ: ""Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee""","Dịka gọọmenti etiti na-egosi mmasị n'ọrụugbo, ọtụtụ mmadụ amalitela itinye isi na ya n'ụzọ dị iche iche.",BBC Igbo mere ihe ngosi a ga-enyere ndị mmadụ aka ịchọpụta mpio na ntubirikọ dị na ya bụ ọrụ. Ochie dika n'ịzụ ụmụanụ bụ Ephraim Chukwu gwara BBC Igbo na ya bụ ọrụ nwere nnukwu uru mana ọ dịghị mfe. Lee ihe okwuru n'ihe nkiri a dị n'elu. Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ga-amasị gị: 42922474,https://www.bbc.com/igbo/42922474,Tinubu: Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ,"Onyeisi otu nọ n'ọkwa ọchịchị nke a na-akpọ, 'APC' bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala okwu maka ihe edemede Obasanjo degara Buhari.","'Edemede ahụ bụ nke aghụghọ' Ọ sị na Obasanjo na-egwu 'egwuregwu ndọrọndọrọ' n'edemede ahụ. Ọ sị na ebe ha abụọ bụ ndịchịrị n'okpuru ndị agha, Obasanjo kwesiri ịkpọ ya n'azụ dọọ ya aka na ntị kama ị gwa ya n'ihu ọha. O ruola izuụka abụọ Obasanjo degara Buhari edemede ahụ na-asị ya ritue n'ọkwa,ghara ịzọ ọchịchị na afọ 2019. Ọ sị na ọbụrụ n'obi dị Obsanjọ ocha, o kwesiri ịkpọ onyeisiala Buhari n'akụkụ gbaa ya izu. O kwuru nke a ebe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Owere (Owerri) ka ọ na-akwado ịga mmemme nkwanye ugwu Alex Ekwụeme." media-46383109,https://www.bbc.com/igbo/media-46383109,Boko Haram ji 'drone' enyo anyị - Ndị agha Naịjirịa,Nke a bụ akụkọ na-emeghee ọnụ.,"Ndị agha ji ụfọdụ ụgbọelu drone enyocha ebe ndị ha na-ebuso agha nọ Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ndị agha Boko Haram ji ngwa agha akpọrọ drone na teknụzụ dị iche iche abata agha ugbua. Ha kọwara na ihe a bụ ihe mere ọtụtụ ndị agha Naịjirịa na-anwụ n'aka ndị Boko Haram ugbua. Ha kwukwara na ndị Boko Haram nwere ọtụtụ ndị agha sị mba ofesi soro ha n'ilụ agha. Ndị agha ole nwụrụ n'ezie? Ndị agha kwuru n'ime nwakpo a niile mere, ndị Boko Haram gburu ndị agha Naịjirịa ruru 23 nakwa ndị agha ọzọ ruru 31 bụ ndị meruru ahụ. Onye nyere ndị Boko Haram drone? Ha kọwara na ugbua ha na ndị ala Chad na-agba mbọ ịhụ na Boko Haram enweghị ohere ị nwakpo ha udi nwakpo ahụ ọzọ. N'ime akwụkwọ ozi ha zipuru ndị ntaakụkọ, a kọwara site ụbọchị 2 ruo 17 nke ọnwa Nọvemba, ndị Boko Haram nwakporo ndị agha Naịjirịa n'obodo Kukawa, Ngoshe, Kareto na Gajiram na Borno steeti. Mana okwu ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ nwakpo awakporo ha n'obodo Metele n'ime Borno steeti. Nwakpo Metele wuru ewu makana ihe nkiri gosiri etu ndị Boko Haram si gbuo ndị agha Naịjirịa pụtara n'elu soshal midia. Ihe nkiri a gbawara ọtụtụ mmadụ obi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" media-49966980,https://www.bbc.com/igbo/media-49966980,Rochas Okorocha: Sineti na-emefu nnukwu ego na ekwesighi ekwesi,Okorocha chọro ka e weleta mmadụ ole ndị na-aga ụlọ nnọchiteanya n'ụlọomeiwu.,"N'uche ya, ""o nweghị ihe mmadụ atọ mere n'ụlọomeiwu otu onye agaghị emeli"". Okorocha sị na a sị ya pụọ na ya bụ ụlọomeiwu ka Naịjirịa dị mma, na ya ga-apụ. O kwukwara na ọ dịmkpa ka Naịjirịa tiny uche na ịchọwa ụzọ ọzọ ha ga-esi kpata ego na abụghị mmanụ agbidi. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44304648,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44304648,Ụlọikpe atụọla Jolly Nyame nga maka mmerụaka,Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja atụọla onye chịbụrụ Taraba state bụ Rev Jolly Nyame nga afọ iri na anọ maka imefu ego karịrị nde naira 250.,"Jolly Nyame chịrị Taraba steeti dịka Gọvanọ bido n' ọnwa Mee 29, afọ 1999 rue Mee 29, afọ 2007. Ọkaikpe Jọstis Adebukola Banjoko mara Nyame ikpe maka 'imefu of nde naira N165 n'ụzọ akwụghị ọtọ'. Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter taa. End of Twitter post, 1 Jolly Nyame, onye otu PDP, chịrị Taraba steeti dịka Gọvanọ bido n' ọnwa Mee 29, afọ 1999 rue Mee 29, afọ 2007. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55106145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55106145,"Igbo Literature: Omenuko, Ije Odumodu, Mbediogu na akwụkwọ Igbo ndị ọzọ ị gaghị echefu echefu maka mwelite ha welitere asụsụ Igbo","Mgbe elu bụ ala ọsa, ọ bụ okwu ọnụ ka ndị Igbo si akọ akụkọ ihe mere oge gboo maọbụ kuziere ndị na-eto eto ihe.","Mana nke a gbanwere dịka ndịọcha bịara weta ụka ma wetakwa agụmakwụkwọ; etu e si agụ,ede. Ọtụtụ akwụkwọ mbụ bụcha na n'asụsụ Bekee mana e mechara nwewe akwụkwọ ndị e dere ede n'asụsụ Igbo bụ ihe Igbo ji akọ akụkọ ifo nakwa nke na-egosi nkwenye ndị Igbo. Lee ụfọdụ akwụkwọ Igbo kara aka nke ihe pụrụ iche na ọtụtụ n'ime ha bụ etu ndị dere ya ji ilu na akpalaokwu were ebi okwu ka ụkpaka : 1. Omenụkọ Omenụkọ bụ akwụkwọ akụkọ ifo(Literature) mbụ e dere n'asụsụ Igbo dịka e bipụtara ya n'afọ 1933. Omenụkọ bụ akwụkwọ ọtụtụ ụmụaka ụmụ akwụkwọ Igbo jiri waa eze n'ịgụ edemede Igbo. Ya bụ akwụkwọ nke Nwosu Pita Nwana ritere nturuugo n'asọmpi akwụkwọ e dere n'asụsụ dịga n'Afrịka nke 'International Institute of African Languages and Culture' haziri. Maazị Pita Nwana, onye ọrụ kapịnta rụrụ ọrụ n'ụlọakwụkwọ 'Methodist College Ụzụakọli' ọtụtụ afọ, ji ilu na okwu gwọọ ya bụ akwụkwọ ka ji abụbọ. Nwana bụ onye 'interpreter' nye ndịọcha na-achịkọta ụlọakwụkwọ ahụ e mechara mara dịka 'Ibo Institute' , gụnyere Rev J Wood bụ onye nlekọta ya bụ ụlọakwụkwọ. Nwana, onye a mụrụ n'afọ 1881 bụ otu n'ime ụmụnwoke ise nne na nna ya bụ onye bụ ọpụrụiche site na oge ọ dị na nwata. Nne na nna ya bụ ndị ọgọ mmụọ mana Nwana tolitere sowe ndị ụka ebe ọ nọ mụta Akwụkwọ nsọ. Ọ nwụrụ n'afọ 1968 oge Agha Biafra ka kpụ ọkụ n'ọnụ mana akwụkwọ ya ahụ mepeere ndị na-ede akwụkwọ Igbo ụzọ. Ọtụtụ gbasoro etu o si eji ilu na itu aha otutu were achọ akwụkwọ ha dere mma. Omenụkọ bụ akụkọ gbadooro ụkwụ n'ihe mere na ndụ otu nwoke a kpọrọ Igweegbe Odum, onye Ndizuogu ma bụrụkwa onye ojiegoachụego. Nwoke ahụ sitere n'ogbenye were ghọọ ọgaranya site n'ịgba mbọ nakwa amamihe dịka ọ gbachaara nna ya ukwu odibo. Mana nwoke ahụ dajọrọ oge o lere ụmụ ndị agbataobi ya na-enyere ya aka n'azụmahịa n'ohu oge ahịa ya dachara mmiri. O mechara gbalie imezi ihe o mebiri. Akwụkwọ Omenukọ bụ akwụkwọ wuru ewu n'Igbo agbọ fere agbọ nke na n'afọ 2010, emere emume icheta afọ 75 e depụtara akwụkwọ ahụ. 2. Ije Odumodu Jere Ije odumodu jere bụ akwụkwọ Leopold Bell Gam dere akwụkwọ n'afọ 1963 bụ akwụkwọ ọzọ tọọrọ atọ ụmụakwụkwọ iji amụ iri elu n'agụmagụ Igbo. Akwụkwọ a bụ akụkọ maka Odumodu, nwa afọ Ahaba hapụrụ ezinaụlọ ya na-agbanyeghị mkpamkpa ndị ntọrị mmadụ, gawa Eko (Legọs) ịchọ akaraaka ya. Ọ nọrọ n'Eko mụọ ọrụ ma na-arụ ọrụ aka dị iche iche ma mecha rụwa ọrụ n'ụgbọmmiri. N'otu n'ime njem ha na-eme ịga ofesi, ebilimmiri tụwara ụgbọmmiri ha, onye ọbula gbasaa ka mkpụrụ ụkpaka. Mmiri bugara Odumodu n'ikperemiri mba Finda ebe ọ nọrọ malite ndụ n'isi. Dịka akụkọ Guilliver's Travel nke Jonathan Swift dere ebe Gulliver zutere ndị Liliput, ndị obodo Finda Odumodu zutere bụ ndị ntịtị mmadụ, ebe Odumodu dị ha ka nnukwu dimkpa toro nnukwu ogologo. Ọ tara ahụhụ na mba ahụ ma mecha bụrụ nnukwu mmadụ lụrụ nwa eze mba Finda ọ mụtara ya ụmụ mana oge egwu dagharịrị, ọ ghọọ onye gba aka nwunye ya na ụmụ ya. N'agbanyeghị njem ya ga nakwa ihe niile ọ gabigara, Odumodu laghachiri n'ala nna ya bụ Ahaba, ebe ndị obodo mere ya eze, ko o were ihe ọ mụtara na njem ya chịkọta ha. 3. Ukwa Ruo Oge Ọ daa Nke a bụ akwụkwọ nke onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Tony Ubesie dere. A mụrụ Ubesie bụ onye Achi dị n'Okpuru Ọchịchị Oji River, Enugwu steeti n'afọ 1950 . Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' ma bụrụ onye ntaakụkọ. Ọ bụ onye na-ede mbem ma bụrụ onye dere akwụkwọ ruru iri na atọ gụnyere; Isi Akwụ Dara n'Ala, Jụọ Obinna, Mmiri Ọku Eji Egbu Mbe, Ụkpana okpoko buuru, na Ụkwa Ruo Oge Ọ Daa bụ nke o dere n'afọ 1973. Tony Ubesie gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka Tony Uchenna Ubesie nwụrụ n'afọ 1994 ka ọ gbara afọ 44. Akụkọ Ụkwa Ruo Oge Ọ daa bụ akụkọ banyere oke ịhụnanya dị n'etiti Ngọzi na Chude. Ukwa Ruo Oge Ya Ọ Daa' bụ akụkọ banyere nnukwu ịhụnanya dị n' etiti Chude na Ngọzi. Na agbanyeghị ọtụtụ ọnwụnwa bịara nwalee mmadụ abụọ, ha etisaghị kama ha nwudosiri n' onwe ha wéré rue oge ha lụrụ onwe ha. 4. Mbediọgụ Akwụkwọ Mbediọgụ bụ akwụkwọ ọtụtụ akụkọ ifo banyere mbe na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ nke Frederick Chidozie Ogbalu(FC Ogbalụ dere. Odogwu nwoke a na-anụ aha ya maka nnukwu mbọ ọ gbara na nkwalite asụsụ Igbo bụ ya na ndị enyi ya hiwere otu Otu Iwelite Asụsụ Na Omenala Igbo nke Bekeee kpọrọ 'Society for Promoting Igbo Language and Culture' (SPILC), n'afọ 1949. Ọ bụ otu ahụ haziri usoro Igbo e ji ede Igbo nke a kpọrọ 'Standard Igbo' na Bekee nakwa ọnụọgụgụ(numerals) n'Igbo(nde,ijeri). Tupu oge ahụ Igbo na-ekwu 'ọgụ kwuru ọgụ', 'nnụ kwuru nnụ', agụkata agba awa...) A ma Ogbalu maka ị bụ onye hiwere akwụkwọ akụkọ Igbo mbụ ọ kọrọ ""Anyanwụ."" Ọ bụ onye Abagana n'Anambara Steeti ma bụrụkwa onye nkuzi sekọndịrị kuziri n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ. E wezụga Mbediọgụ, Ogbalu dere ọtụtụ akwụkwọ Igbo gụnyere Nza Na Obu, Akwukwo Ogugu Igbo, Okowa Okwu (Igboo dictionary), Ebube Dike, Dimkpa Taa Aku A hu Ichere Ya,Okwu Ntuhi (riddles) Obiefula, Uwaezuoke wdg. Otu n'ime akụkọ ahụ dị n'ime Mbediọgụ bụ maka ihe mere mbe ji ezo onwe ya n'ime okpokporo ya. Nke a bụ akụkọ etu oke ụgani si daa n'ala ụmụ anụmanụ nke na a hụghị ihe e riri. Mbediọgụ gara n'ọhịa ịchọ ihe ọ ga-eri ma hụ akwụ chara acha. Ọ rịa elu gbutuo ya mana ogbe akwụ ahụ dabara n'ọnụ. Mbe soro ọnụ ahụ chọọ ogbe akwụ ya gawa ma hụ onwe ya n'ala mụọ ebe ndị mụọ na-ata akwụ ya. Ha rịọọ Mbe ka ọ hapụrụ akwụ, were ịgba nri.5. Onye Ọma Emeka, Onye Ọma Emeka bụ akụkọ maka Emeka Okoro, nwatakịrị nna ya zigara ka ọ gaa akwụkwọ, na-agbanyeghị na ya onwe ya bụ onye ọgọmmụọ. Mba Okoro zigara nwa ya ụlọ akwụkwọ n'ihi ahụhụ ọ gabịgara oge ọ rụrụ ọrụ kọmpịnị n'ihi agụghị akwụkwọ. Mana nne Emeka na ụmụnne ha akwadoghị nke a n'ihi egwu na ịga akwụkwọ ga-eme ka nwata ahụ gbahapụ omenala ndị obodo gawa ụka nke nwere ike ime ya ka ọ ghara ịkwa nna ya n'ụzọ omenala ma ọ nwụọ. Emeka gara akwụkwọ gụruo koleji ma nweta ọrụ na bido mebe fụma, nke mere na ọ dịzị ndị ọgbọ ya na-achịbu ya ọchị ka ha bụrụ ya. O mechara bụrụ onye e zigara ala bekee ịgụkwụ akwụkwọ dị elu, ma lọtazie bụrụ nnukwu mmadụ n'ụlọ ọrụ ya. E mechara mee ya Minista. Emeka zigara ụfọdụ ndị okorobịa obodo ha mahadum ma jiri ọkwa ya mere ndị obodo ya ọtụtụ ihe mmepe obodo. 6. Chinaagọrọm Ọ bụ Julie Onwuchekwa dere Chinagọrọm n'afọ 1983. Onye nkuzi mahadum bụ ọkammụta n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ndị nwere ọlụsị nke Bekee kpọrọ 'Special Education na mahadum 'University of Ibadan' a mụrụ Onwuchekwa n'afọ 1944. Akwụkwọ a bụ akụkọ otu nwata nwaanyị aha ya bụ Chinagorom. Chinagọrọm gụrụ akwụkwọ dị elu oge ụmụnwaanyị ịga akwụkwọ abụghị ihe e jiri kpọrọ ihe, oge a na-ahụta iziga nwaanyị akwụkwọ dịka itufu ego nakwa imepe nwaanyị oke anya. Mana na-agbanyeghị etu ndị oge ahụ si ahụta nwaanyị gụrụ oke akwụkwọ, Chinagorom bụ nwa nne na nna ya mụtara naanị ya lụtara Chinedu bụkwa nwoke gara ala Bekee gụọ akwụkwọ ma na-arụkwa ọrụ n'ụlọ mmepụta mmanụ ụgbọala. Chinagorom gabigara ọnwụnwa di icheiche nke gụnyere ebubo ụgha e boro ya na ọ tụtara ime n'ezi oge di ya gara ala Bekee ịgụkwu akwụkwọ. Mana eziokwu mechara pụta ihe dịka di ya bụ Chinedu Chijioke gbara akaebe na ọ bụ ya tụwara nwunye ya ime. 7. Ọkpa Akụ Eri Eri Ọkpa Akụ Eri Eri bụ akwụkwọ Igbo ọzọ ụmụaka jị waa eze n'agụmagụ Igbo agaghị adị nchefu. Ọ bụ Maazi Ude Odilora, onye Ụmụnachị n'okpuru ọchịchị Dunukọfịa, ma bụrụkwa onye nkụzi Sekọndịrị dere ya. Onye gụrụ asụsụ Frenchị na mahadum 'University of Nigeria Nsukka', Odilora kuziri n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Ha gụnyere Igwebuike Grammar School Oka, Anglican Secondary School Adazi na Umuchu High School ebe ọ nọrọ laa ezumike nka dịka onyeisụlọakwụkwọ. Ọkpa Akụ Eri Eri bụ akwụkwọ mbụ o dere. Akwụkwọ a bụ akụkọ maka Akụbụzọ, onye nkụzi a ma ama n' obodo Abangwu ebe ọ bụ onyeisi ụlọakwụkwọ. Akụbụzọ bụ nwoke mara mma, gbaa dimkpa ma nwekwa oke mmụta. Ọ dị ike ọrụ ma na-etinyekwa uchu n' ọrụ ubi. Ihe niile ọ na-eri bụ ihe ọ kọpụtata n' ubi. Mana ọ bụ onye aka ike, ọ naghị ewepụta aka eri ezigbo ihe maọbụ nye mmadụ ihe. Ọ chọghịkwa ịzụta nwaanyị ga na- eriri ya akụ ya.Ọ dịghị ihe na-ala ya n'iyi,ọbụladị nsị, bụ ihe ọ na-eji ya na- aja akọ ihe. Ihe ndị a niile bụ iji chekwa ego ọ ga- eji aga ala Bekee. Mana oge ị ga-ala Bekee rutere nso, ọ gara n' igbe ọ zoro n'okpuru akwa ebe ọ na- etinye ego, ọ bụrụ na akịka atagwoola ego ọ na- atụkọ iji gaa ala Bekee. Ụkwụ were jie agụ dịka nwa amadị ahụ ahụghịkwa ego o jiri mee ọchịchọ obi ya. Ndị mmadụ kwara ya emo kpọọ ya""ọkpa akụ eri eri""." afirika-51163537,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51163537,Igbo Actors: Ha achọrọ Biafra ka ọ bụ ha achọghị Biafra?,Okwu Biafra bụ okwu na-emetụ otutu ụmụafọ Igbo n'obi.,"Dịka otu dị iche iche dị ụgba na-ama ọkwa maka enweta Biafra. Ndị dịka Anne Njemanze, Klint the Drunk, Noble Igwe na otutu ndị ọzo gwara BBC uche ha maka ịnweta Biafra. Lee ihe niile ha nwere ikwu maka okwu a." afirika-50827582,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50827582,Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị?,BBC Igbo bara ime ahịa ime nchọpụta etu akwa na ihe ndị ọzọ si adala ọnụ n'oge ekeresimesi a.,"N'ahịa Ogbete dị n'Enugwu, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n'igwe ịzụkọrọ akwa ndị ha ga-eji gbaa ekeresimesi. Ndị na-ere akwa ndị a sị n'agbanyeghi na ngwaahịa dalara ọnụ, na o gbochighi ha erela ahịa nkeọma. Otu onye ọzọ sị na ahịa nke afọ dị mma nye ya karịa nke afọ gara aga. Kirie ihe anyị chọpụtara n'uju ebe a; Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45094444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45094444,Akpabio agbaala arụkwaghịm,Onye ndu ndị kachasị nta n'ụlọomeiwu ukwu a na-akpọ 'Minority Leader' n'asụsụ bekee bụ Godswill Akpabio arịtuola n'ọkwa ya.,"O kwuputara nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ n'akara soshal midia ya. Ndị mmadụ na-ekwu na o nwereike ị gafere na pati ndị APC mana o kwubeghị ya n'onwe ya. End of Twitter post, 1 O kelere ndị ụlọomeiwu na nkwado niile ha nyere ya mgbe ọ bụ onyeisi ha. Nke a na-abịa dịka ya na Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nwere nzụkọ na London na ngwụcha izuụka gara aga. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o bụ etu a ka ekwesiri ị si mee ma onye chọọ ịfee na pati ọzọ dịka @giftedbroda si kwuo. Ebe ndị ọzọ na-akatọ ya na-ekwu na ọ bụ onye mmehie dịka @stainlesphoenix si kwuo. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-57065762,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57065762,Kidnapping in Nigeria: Nkwarụ aka m zọrọ m n'aka ndị ntọ - Juliet Okoloji,Nwaada Juliet Okoloji kọwaara otu nkwarụ ọ nwere n'aka si zọpụta ya n'aka ndị ntọ.,Ya bụ nwaada Igbo gụrụ akwụkwọ kọwaara BBC Igbo ka aka ya nwere nkwarụ bụ nke na-emebu ya ihere si mechaa bụrụzịa ihe zọrọ ya ndụ n'aka ndị ntọ chọrọ iji ya gwọọ ọgwụ ego. Lee ka o siri mee. afirika-45268168,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45268168,Amabeghị etu ọkụ si baa n'ụlọikpe dị n'Orlu,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na ọkụ bara n'ụlọikpe ""Magistrate"" nke dị n'Orlu taa, mana ọ sị na amabeghị ma aka mmadu ọ dị ya.","Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos Enwerem kwuru na-agbanyeghị na ndị uweojii na ndị ọrụ gbata gbata ndị ọzọ gbagara ebe ihe a mere, ọtụtụ akwụkwọ dị n'ụlọ ahụ lara n'iyi tupu ha agbanyụọ ọkụ ahụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụlọ a ọkụ metụtara ka kwụ ọtọ, na ọkụ emebeghi ya. Ụfọdụ ndị akwụkwọ ntaakụkọ dere na aka mmadụ dị n'ihe mere, mana Enwerem kwuru na ha amabeghị maka nke ahụ, dika ha ka na eme nchọpụta ka ha mara nke bụ eziokwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48257410,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48257410,Agriculture in Nigeria: 'Eji m ọrụ ugbo achụ ụbịam na agụụ ọsọ ụkwụ erughi ala',"Maazị Agbodike bụ onye gụrụ akwụkwọ na ngalaba ihe osise bụ 'Arts' na bekee, hapụrụ ya ma banye n'ịkọ ugbo.","O kwuru na ọ bụ n'ihi ịchụ ụbịam na agụụ ọsọ mere o jiri malite ọrụ ụgbo n'ebe dị iche iche na Naịjirịa. N'ihe onyonyo a, BBC Igbo so ya gaa n'ugbo ya dị n'Anambara Steeti, ịchọpụta etu o si eme ya bụ ihe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46015374,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46015374,Onye oziọma si US anwụọla naanị ụbọchị 12 ọ kwatachara Africa,Akụkọ dị mkpa taa: Ogbugbu onye oziọma,"Ndị omekome agbagbuola onye mba Amerịka na-ezisa oziọma n'obodo Bamenda dị na Kamerun. Charles Wesco na ezinaụlọ ya kwatara mba Kamerun naanị ụbọchị 12 tupu a gbagbuo ya Mgbọ tụrụ Charles Wesco n'ime ụgbọala bu ya na nwunye ya aga ahịa ka ndị agha nchekwa na ndị agha ndị chọrọ inwere onwe ha nọ na-akwa mgbọ. Ejidela ndị ntọ n'Imo steeti. Aka akparala mmadụ ise a na-enyo maka ntọ ndị na-efe ala nna ha n'Imo steeti. Godson Orlando Ikoku bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC na a hụrụ ihe mgba ama n'aka ha mere e ji nwụchie ha maka ịgba ha ajụjụ ọnụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Aka akparala ndị tọrọla ụmụ NYSC n'Imo Na mba ofesi, Nwatakịrị dị naanị afọ iri na asaa a kpọrọ Mikhail Zhlobitsky, ejirila ogbunigwe gbagbuo onwe ya n'ime ụlọọrụ ndị nchekwa n'obodo Arkhangelsk dị na mba Rọshịa. Ihe ose foto nke CCTV setere ya ka ọ banyere n'ime ụlọ ahụ Mgbapụ ogbunigwe a merụrụ mmadụ atọ na-arụ n'ụlọọrụ ahụ ahụ ma mebikwaa ụfọdụ ihe. N'egwuregwu, Gianni Infantino bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ FIFA kwuru na ha nwereike iwelite aka n'ọnụọgụgụ otu bọolụ ole ga na-esonye n'asọmpi Iko Mbaụwa site na mba iri atọ na abụọ ruo iri anọ na asatọ n'afọ 2022 kama 2026 a na-atụ anya ya. Ndị Gọvanọ ekpebiela Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ọ bụ naịra puku iri abụọ hoohaa ka ha ga-akwụ n'ụgwọ opekatampe dịka ha na mịnịsta dị ịcheiche mechara nzụkọ ụnyaahụ n'Abuja. Cheta na ngalaba na-ahụ maka ịkpuchi ndị ọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ tinyere ụbọchị isii na Novemba iji mee aụbọ ọrụ ga-eme ka gọọmentị mezuo ụgwọ opekatampe naira puku iri atọ. Ego a ọ ga-ezuru ndị ọrụ? Ọzọ Onyeisi ndịuweojii esila n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha bụ Jimoh Moshood gwa steeti ndị gbara Abuja gburgburu ha kee nkwụcha. O kwuru nke a dịka ha nwụchiri ndị ụka shiites ruru mmadụ narị anọ na-eme ngagharị iwe maka nwuchi onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky kemgbe afọ 2015. Na mba ofesi, Ndị mmadụ emeela ngagharịwe na mba Amerịka mgbe onyeisiala ha bụ Donald Trump gara ịleta ebe anọ gbagbu ụfọdụ ndị na-ekpere ụka Juda na ngwụcha izuụka gara aga. Mmadụ karịrị otu narị kwụchiri okporoụzọ na-egosi iwe ha dịka ebidoro ịli ụfọdụ ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo. N'Egwuregwu, Otu Egwuregwu Leicester City ekwuola n'asọmpị dị n'etiti ha na otu Cardiff ga-aga n'ihu n'agbanyeghi ọnwụ onye nwe ha bụ Vikai Srivadhanapraba. Mana ha ga-akawnayere ya ugwu otu nkeji tupu egbuo opi mbido asọmpị ahụ n'ụbọchị satọde. Gee Nkeji nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa 'Ndị ibe anyị na-azọkwasa anyị ụkwụ n'isi' - Uko" afirika-57324983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57324983,Drone Technology: 'Agaghị m ụlọakwụkwọ were mụta etu e si arụ 'drone' - Agbo Samson,Nwokoroọbịa Agbo Samson na-arụ igwe na-efe n'elu nke bekee kpọrọ Drone akọọla njem etu o siri bido na-agbanyeghị na ọ gaghị akwụkwọ maka ya.,O kwuru na ọ bụ na J.s.s 3 ka ọ malitere rụwa ya bụ drone. Agbo kwuru na o nweghị ego mana o bidoro rụwazie nke ukwu na ngwụcha 2020. O kwuru na uru drone ya ga-enyere na-ebugara ndị mmadụ ihe dịka kpachị kpachị na-enye nsogwu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche. O kwuru na ọ bụ na intanet ka ọ na-azụta ụfọ̄dụ ngwaọrụ ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 43604139,https://www.bbc.com/igbo/43604139,Akụkọ kachasị taa: PDP asaala APC okwu,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"PDP asaala APC okwu Otu PDP ekwuola n'aha Gọọmenti etiti nke APC nọ n'isi ya wepụtala dika ndị ha na-ebo ebubo na ha zuru ego Naijiria n'oge ọchịchị PDP bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọ n'ihi na e nwere ọtụ ndị nọ na ọchịchị APC eborola ebubọ mmerụaka aka. Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017 N'ụbọchị Friadee, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ, Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmenti etiti na-ebo ebubo na ha zụrụ ego ala Naijiria n'oge ọchịchị PDP. Ohaneze agbarala IPOB ọnụ Ohaneze nke onyeisi ya bụ Nnia Nwodo na-enwe ndị kwe na ndị nekweghị n'okwu gbasara 'Restructuring' Otu Ohaneze Ndị Igbo adọla IPOB aka na nti ka ha ghara ịbia mkposa ọgbakọ maka ihazihari Najiria na mpaghara nke a kpọrọ restructuring , nke otu a na akwado. Nke a mere, ka ha nụtara kepukepu na IPOB chọrọ ịbia kposa ọgbakọ ha na-akwadọ. Mba Amerịka enyela ọnọdụ ọhụrụ maka inweta akwụkwọ ha Ọchịchị Trump enwerela ọtụtụ nhazịgharị ndị mba ọzọ sị abata Amerịka kemgbe ọ rigoro n'ọkwa dịka onnyeisiala Ọchịchị Donald Trump nke Amerika ekwuola na ha ga-ebudo na-enyocha ihe onye obula na-achọ ịnata akwukwo ibata ala ha mere n'igwe okwu sochal midia. Na egwuregwu, David Warner ejiri anya mmiri riọ mgbaghara David Warner tụrụ arịrị na n'ikekwa, ya aghaghị enwe ohere gbara Austrialia kriket ọzọ Onye egwuregwu Kriket mba Australia bụ David Warner ejiri anya mmiri riọ mgbaghara maka aka otinyere na wuruwu bọọlu nke mere na mba Saaut Afrika. A machiri Warner na onye bụbu kaptin bụ Steve Smith otu afọ maka ebubo ikpa bọọlụ aka dịka osi megide iwu na Cape Town." afirika-50396359,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50396359,Rice Processing: Usoro e ji emepụta osikapa,Ihe nkiri a ga-egosi etu ngalaba ọrụ ugbo Coscharis si emepụta osikapa aja adịghị.,"Ụlọọrụ a na-emepụta osikapa bụ nke dị n'Anambra steeti amalitela ịrụpụta osikapa gbanyụụ n'ala Igbo. Ha na-eji igwe ọrụ bekee dị iche iche emepụta ya bụ nri. Coscharis nwere obosara ala n'Amakụ, Anambra steeti ebe ọ na-akọpụta ya bụ osikapa. Ihe nkiri a ga-egosi gi ihe ya bụ osikapa na-agabiga tupu ọpụta ihe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-55790860,https://www.bbc.com/igbo/media-55790860,Africa Eye: 'O nweghi onye ga-etigbunwu m n'Afrịka niile - Jane Mugo,Jane Mugo bụ onye nnyocha nzuzo a na-achọ ka akara ọkụ na mba ebe o si bụ Kenya.,Ndị mmadụ na-achọ ya maka enyemaka ọ na-enya ha na nnyocha ebe ndị omekome na-achọ ya maka ọrụ ọ na-emebiri ha. Jane Mugo kọwaara Africa Eye etu o si arụ ọrụ ya na mba ebe ndị mmadụ enweghi ntụkwasị obi na ndị uweojii. Lee ihe BBC chọpụtara maka ya n'uju: Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-43978134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43978134,Ụmụaka isii adabala n'ime olulu nsi na Kenya,Akụkọ si Kenya eru anyị ntị na-akọwa na ụmụakwụkwọ isii dabara n'ime ụlọ mposi n'ụtụtụ Wenesde.,"A na-akọwa na ọ bụ miri ozuzo mere ụlọ nsị jiri zee Ndị ụlọ ntaakụkọ Citizen TV kwuru na ihe a mere na mpaghara Nakuru county , nke ndị n'ugwu isi obodo Kenya bụ Nairobi. End of Twitter post, 1 Ụlọ ntaakụkọ Standard dele na onyeisi nkuzi n'ụlo akwụkwọ Kisulisuli kwuru na ụmụakwụkwọ anọ n'ime ndị a pụtara ma onweghị ihe mere ha , mana abụọ n'ime ha merụrụ ahu. Onye ntaakụkọ sị ụlọ ntaakụko ọzọ na-ekwu na ọsọ ụmụaka ise ka a kpọpụtara, ka otu ka nọ n'ime onunu. Akụkọ ga-amasị gị:" 43014409,https://www.bbc.com/igbo/43014409,Onye akaebe ekwuola na a kpọrọ ya n'ọrụ ọchụ Ozubulu,"Chukwujekwu Eze kwuru n'ụlọikpe ukwu dị na Nnewi, Anambara Steeti na a kpọrọ ya n'ọrụ imemila otu nwoke bụ Aloysius Ikegwuonwu nke ama ama dịka, 'Bishọp' mana ya ekweghị n'ihi na ya achọghị inweta ego site n'ịkwafu ọbara.","Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 Ndị ji egbe gbagburu mmadụ iri na atọ ndị biara ụka na, St Philip Catholic Church, Ozobulu n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017. Chukwujekwu Eze kwuru sị: ""O nwere otu nwa nwoke aha ya bụ Okpanda onye gwara m na ha chọrọ ịga be 'Bishop' n'Ozubulu ga rụọ ọrụ. ""A jụrụ m ya ụdị ọrọ ọ bụ, ya agwa m na Bishop ji ndị mmadụ ụgwọ na Saụt-Afrịka, na ha chọrọ ịga be ya gbagbuo ihe niile dị ndụ. ""A jụrụ m ya onye zigara ha, ya asị na ọ bụ Obrocho. Mgbe m kwulitere ya, Okpanda, kwuru na ọ ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na m soro gaa ọrụ n'ụlọ Bishọp. Agwara m ya na achọghị m ịkwọ aka ọbara."" Eze gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ọ gara ịza oku Okpanda kpọrọ ya n'ụlọ ya ụbọchị so ụbọchị ahụ ka ọ hụrụ Dobby (Onyemaechi Mbanefo), otu na ndị eboro ebubo na ha kpara mkpamkpa ahụ, ha abụọ ndị gbara mbọ rịọ ya ka o soro gaa ije ahụ mana o kweghị. Ndị e boro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44. E jidebeghị ndị ọzọ e kwuru na ha soro mee mpụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57090751,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57090751,Constitution Amendment: 'Ndị omeiwu Naịjirịa na-aghọrọ onwe ha aghụghọ na ị sị na ha ga-edegharị akwụkwọ iwu Naịjiria',"Dịka ndị Gọvanọ Ndịda Niajiria kpọrọ oku ka Goomentị Etiti kpọọ ọgbakọ maka itinye ọnụ n'okwu gbasra ịhazịgharị Naịjirịa, ụlọomeiwu Sineti enwerela ọsọ kpọọ oku maka itinye ọnụ n'okwu gbasara ịhazigharị iwu Naịjirịa nke 1999.","N'ozi ha wepụtara, ha kwuru na ha amapụtala ebe na oge ndị mmadụ ga-eji ezuko itinye ọnụ n'ihe ha chọrọ ka a hazigharịa n'Iwu Naijiria. Nke a butere ọtụtụ mmadụ ịmalite ikwu ihe gbasara imegharị iwu Naịjirịa nke Bekee kpọrọ ""Constitution"". Ọtụtụ mmadụ akpọọla ya bụ akwụkwọ aha ọjọọ na-arụ ya aka ajọo n'ụdị na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu bụ isi sekpụ ntị n'ihe na-akpọtụ na Naịjrịa. Ụfodụ na-ekwu na e dere ya mgbe ndị agha na-achị bụ mgbe ha kpọbatara mmadụ ole maọbụ ole n'otu ụlọ nye ha ọrụ ịde ya bụ akwụkwọ iwu bo ya na ""we the people"" dere ya. Ebe ọtụtụ mmadụ na ndịda na-ekwu na e kwesiri ịde nke ọh uhụrụ, ndị Ugwu na-ekwu ka e degharịa ya. Kedụ nke anyị ga-eso? Nwada Igbo bụ Oby Ezekwesiri na-ekwu n'akara Twitter ya n'ụtụtụ a na ọ bụ 'constitution'ọhụrụ ka ekwesiri ị na-ekwu maka ya, ọbụghị idegharị nke ochie. Onye okaiwu bụ ọkachamara n'okwu gbasara ịme akwụkwọ iwu bụ Tony Nnadi ekwuola na ndị omeiwu Naịjrịa enweghị ikike ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjria. Ndị omeiwu Sineti pụtara n'ụtụtụ Wenezde kwụọ na ha chọrọ ịmalite njem ịnye ọhaneze ohere ịtịnye ọnụ n'okwu gbasara ịmegharị iwu Naịjirịa. Mana Tony Nnadị bụ ọdeakwụkwọ ndị Lower Niger Congress bụ otu agburu di icheiche na Naịjirịa gbakọrọ ọnụ si na ""ndị omeiwu ahụ na ndị Gọvanọ na-aghọrọ onwe ha aghụghọ"". Ọ sị na ""ikike ndị omeiwu erughị na ịdegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa maka na ọ bụ ya bụ akwụkwọ iwu nyere ikike ihiwe ha"". 'Ndị omeiwu Naịjirịa na-aghọrọ onwe ha aghụghọ ịsị na ha ga-edegharị akwụkwọ iwu' Ọ sị na ọ bụ ndị agbụrụ dị icheiche na Naịjrịa kwesiri ịgbakọta hiwe akwụkwọ iwu nke mgbe ha mechechagoro ""referendum"" n'ime onwe ha kwekọrita na ha ga-ebi. Nnadi kwuru na ""mgbe ahụ ka ya bụ akwụkwọ iwu ga-abụ nke ndị nwe ya"". Ochiedike so na gọọmentị ọnwụnwaanya mgbe Odumegwu Ojukwu chịrị bụ Mbazuruike Amachi kwetere na ndị omeiwu ahụ enweghị ike ịdagharị iwu Naịjiria. O kwuru na agbanyeghị nke a, na-akwụkwọ iwu Naịjrịa enwere ughua bụ nke adigboroja maka na ọ bụghị ndị Naịjriia dere ya. ""A ga-ede usoro ọchịchị Naịjirịa nke ọhụrụ ka ndị Naịjirịa kwuo ka ha ga-esi chia onwe ha"", dịka Mbazuruike kwuru. ""Akwụkwọ iwe e ji achị Naịjirịa abụghị nke Naịjrịa"" - Mbazulike Amechi ""Ịdegharị akwụkwọ iwu adigboroja a dịka ịda iwu ugboro abụọ."" O sị na ọrụ ndị omeiwu bụ iji akwụkwọ iwu Naịjrịa mepụta iwu, na ọ bụghị ịdegharị ya bụ akwụkwọ. O kwukwara Gịnị mere akwụkwọ iwu Naịjria ka ọ dị ugbua? Tony Nnadị bụ ọkachamara gbasara akwụkwọ iwu kwuru ihe mere o ji dị mkpa ịde akwụkwọ iwu ọhụrụ. Ihe ndị a ka o kwuru: Mmachi ịchịgharị ehi, 'state police' na mkpebi ndị ọzọ ndị gọvanọ Ndịda Naijiria kpebiri Ndị gọvanọ Ndịda amachiela ịchịgharị ehi na mpaghara ahụ iji belata nsogbu ọchịehi na mpaghara ahụ. Ndị Gọvanọ Ndịda Naịjria zukọrọ n'Asaba, Delta Steeti ụbọchị Tuzde, abalị iri na otu nke ọnwa Mee afọ 2021, tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọdịmma, nchekwa, ndị kwe ndị ekweghi gbasara ịdịnotu Naịjrịa nakwa agha gbasara Covid-19. Ihe ndị a ka ha kpebiri: 1. Ha kwekọrịtara na ndị agbụrụ dị na ndịda kwere na idinaotu Naịjrịa nke hibere isi n'ikpe nkwumọtọ, onye biri ibe ya biri, udo na ịhụnanya na ofu obi. 2. Ndị Gọvanọ ahụ agbakọọla aka machie ichi ehi gagharịa na steeti niile ha na-achị maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa nke na-emetụta udọ na ịkpata akụ nke ndị mmadụ jiri biri. Ọzọ bụ na mmụbanye mmadụ mere ka ala dị ụkọ nke butere na ala ezughịzị ihe e ji ya eme na mpaghara ahụ. 3. Ha chọrọ ka gọọmentị etiti hapụ steeti chọrọ ka ha mepee usoro dị ha mma ịkpa ụmụanụ. 4. Ha kwekọrịtara na ọdị mkpa na gọọmentị etiti ga-egosi mmasị, ngwa ngwa, n'ịhazịgharị Naịjirịa n'ụdị ga-enye steeti dị iche iche ikike ịhiwe ndị uweojii nke ha, kegharịa usoro e ji eke akụnaụba Naịjirịa nke ga-egosi nke Bekee kpọrọ ""true Federalism"". Ha kwuru na ọ dị mkpa gọopmentị etiti ihebe ọgbakọ ebe a ga-anọ kpaa mkpa ọdịmma na ịdịnaotu nke Naịjirịa ngwa ngwa. 6.Ha na-akpoku gọomentị etiti ka ha ịge ntị na mkpu ndị mmadụ na-eti maka oke ruru ndị mpaghara dị iche iche maka ọkwa wenitara isi dịka ọkwa onyeisi ndị agha na nke ndị isi uweojii. Ka ha were ọsọ were iji kegharịa ha 7. Ndị Gọvanọ ahụ kpebiri ijikọọ ọnụ na ịdị n'ọtụ nke Naịjirịa. N'ihi ya, odeakwụkwọ ndị steeti niile dị na ndịda anyanwụ ga-ezuko wepụta atụmatụ ha ga-eji hiwe usoro mmekọrịta na-etiti steeti ndị a maka mmepe akụnaụba ha. 8. Ha kpebiri na gọọmentị etiti kwesiri ịmepe odoụgbọmmiri na steeti ndị ọzọ nke ga-enyeaka ka kpachịkpachị na-adị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa, Legọs benata, mekwa ka ọrụ bụrụ gbanyụụ na steeti ndị a. 9. Ha dọrọ aka na ntị maka ihe ikpochi akụnaụba ọzọ maka egwu coronavirus nwereike ibute ma kwukwa ka gọọmentị etiti na nke steeti tikọo isi ọnụ wepụta atụmatụ ga-abara ọha. 10. Ndị gọvanọ ahụ dọrọ aka na ntị maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa ma kpokuo Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ pụta gwa ụmụ Naịjirịa okwu maka ya maka ịme ha ntụkwasị obi ha na gọomentị ya gbagote. Uzodinma anọghị na ọgbakọ ahụ Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti agaghị ọgbakọ ndị gọvanọ Ndịda Anyanwụ Naijiria mere n'Asaba Isiobodo Delta Steeti, ụbọchị Tuzde. Ọ dọghị anya ihe mere na Uzodinma ejighị bịa ọgbakọ ahụ ndị gọvanọ iri na ise si Ndịda bịara n'onwe ha. Mana Odeakwụkwọ Mgbasaozi Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu, kwuru na o nweghị ndajọ dị na Gọvanọ Uzodinma agaghị ọgbakọ ahụ. Ọ sịrị: ""Ọ bụ osote gọvanọ nọchitere ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ na gọvanọ na-eziga osote ya ị ga-anọchite ya."" ""Ọ bụghị nanị ya bụ gọvanọ na-eziga mmadụ ịnọchite ya n'ọgbakọ."" Ndị gọvanọ Ndịda bịara ọgbakọ ahụ bụ: Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu, SAN Gọvanọ Ondo Steeti Victor Okezie Ikpeazu Gọvanọ, Abia Steeti Emmanuel Udom Gọvanọ, Akwa Ibom Steeti (Osote ya bụ Moses Ekpo nọchitere anya ya) Diri Draoye Gọvanọ, Bayelsa Steeti Willie Obiano Gọvanọ, Anambra Steeti Ben Ayade Gọvanọ, Cross Rivers Steeti Ifeanyi Okowa Gọvanọ, Delta Steeti David Umahi Gọvanọ, Ebonyi Steeti Godwin Obaseki Gọvanọ, Edo Steeti John Olukayode Fayemi Gọvanọ, Ekiti Steeti Ifeanyi Ugwuanyi Gọvanọ, Enugu Steeti Hope Uzodimma Gọvanọ, Imo Steeti (Osote ya bụ Placid Njoku nọchitere anya ya) Babajide Sanwo-Olu Gọvanọ, Lagos Steeti Dapo Abiodun Gọvanọ, Ogun Steeti Isiaka Adegboyega Oyetola Gọvanọ, Osun Steeti Oluwaseyi Abiodun Makinde Gọvanọ, Oyo Steeti Ezenwo Nyesom Wike Gọvanọ, Rivers Steeti Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 42974891,https://www.bbc.com/igbo/42974891,Hyginus Umeje: Kwụsinụ ịba ụgbọala n'adịghị mma!,"Onyeisi ụlọọrụ n'ahụ maka ihe gbasara njem okporoụzọ na Lagos steetị akpọrọ Hyginus Omeje, adọọla ndị na-eme njem okporoụzọ aka na ntị ka ha ghara ịba ụgbọala na-ezuchaghị oke ọzọ maka ịdabanye ihe mberede okporoụzọ.","Otu n'ime ụgbọala ndị ahụ kụkọtara isi ọnụ ụnyaahụ n'okporoụzọ Lagos-Ibadan O kwuru nke a maka ihe mberede okporoụzọ mere ebe ụgbọala bu mmanụ agbịdị na nke bu nkpọ (container) ndị mmadụ nọ n'ime ya sukọtara ọnụ ma nwuru ọkụ. Ọ sị na mgbe ọkụ ahụ na-agba onweghị onye ma na mmadụ nọ n'ime ya bụ nkpọ. Amataghị n'oge na mmadụ nọ n'ime ụgbọala a mgbe ọkụ bidoro gbawa A kara igbochịnwụ ya bụ ihe mberede? Hyginus kwuru na ụzọ ihe ndị a bụ ihe a ga-eme iji hụ na-egbochiri udịrị ọkụọgbụgba ugbọala mmanụ agbịdị ndị a na-ebute: Okwukwara na ọbụrụ na gọọmentị etiti ruzie ụgbọoloko ndị dị na Naijirịa, ọ ga-abụ ụzọ ọzọ ka mma eji ebupu mmanụ agbịdị. O kwukwara na onweghị mgbe gọọmenti Lagos jiri kwụsị ụgbọala na-ebu mmanụ agbịdị ịgba n'ehihie kama ọ bụ nanị ụgbọ ndị na-ebu ibu ndị ọzọ. N'otu aka ahụ, onyeọrụ nchekwa njem okporoụzọ n'obodo Iba dị na Legọs akpọrọ Adeyemi Obagbemiro kwuru sị na onye ọkwọ ugbọala bu mmanụ agbịdị ọbụla kwesịrị iburu ụzọ ga-mụọ etu-esi ebu ibu dị arụ ma dịkwa mmiri. Ọ sị na ya bụ ọkụọgbụgba mere ụnyaahụ agaghị eme maọbụrụ na ihe eji emenyụ ọkụ abụọ kg itoolu (9kg) dị n'ime ụgbọala abụọ ahụ kụkọtara isi ọnụ. N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ọ si na ndị FRSC na ndị otu ndị ọzọ n'ahụ maka nchekwa okporoụzụ na Naijirịa n'abiakọta ọnụ iji hụ na ihe mberede okporoụzọ belatara." egwuregwu-44339769,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44339769,Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu,Onye ntaakụkọ BBC na Lọndọn bụ Peter Okwoche gbara ụmụ afọ Naịjirịa bị na Lọndọn ajụjụ maka ebumnobi ha n'ebe Super Eagles nọ.,"Ha kwuru na super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke Rọshịa 2018, na ha ga-eru agba anọ ma ọ bụ ọkara ikpeazụ. Ha gara n'ihu kwuo na onweghị otu bọọlụ ọbụla ndị Super Eagles na-atụ egwu. Onye ọzọ kwuru na ọ bụ mba Beljọm ka ọ na-atụ egwu n'asọmpi ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49035075,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49035075,Minimum Wage: Anyị ga-akwụ ya mana gọọmentị etiti ga-enyere aka - Steeti dị n'ọwụwa Anyanwụ,"Dịka Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari nyere iwu ka ebido kwuwa ndị na-arụrụ gọọmenti etiti ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe N30,000, ihe ndị mmadụ na-ajụ bụzị:Kedụ mgbe ndị steeti ga-ebido soro ṅụwa mmiri ọma ahụ?","BBC juru ndị steeti dị n'Ọwuwa Anyanwụ ebe ha kwụ na imezu nkwa ịkwụ ndi orụ steeti ụgwọ a. Ndịọrụ Nigeria na-esi ọnwụ na ụgwọ opekatampe ga-abụlrịrị N30,000 Lee ihe ha nwere ikwu : Abia Steeti ga-akwụ ụgwọ opekete mpe N30,000 Gọvanọ Ikpeazu bu ọdị nma ndị ọrụ Imo steeti n'obi Dịka BBC na Onyebuchi Ememanka bụ onyeisi Ntaakụkọ nke Abia Steeti kpara nkata, o kọwaara na Abia steeti agaghi enupuisi dịka edebaala ụgwọ a n'iwu Naịjirịa. O kwukwara na steeti niile nwere ọpụrụ iche nke ha dị iche iche, ma bụru kwa n'obi na ndị orụ Abia Steeti ga-enwe nghọta ebe gọọmenti Abia steeti nọ. Ememanka kwukwara na ugwọ opekatampe nke mbu gọomenti etiti hibere, na Abia Steeti gbaliri kwuo ya. Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obiano Don Adinuba bụ Komịshọna na ahu maka igbasa ozi n' Anambra steeti ekwuola na Anambra steeti ga-akwụ ugwọ opekatampe a. Kama ha na-eche ka ndị Gọọmenti etiti ngalaba nke na-ahu maka ọrụ tuziere ha aka etu a ga-esi kwụọ ụgwọ a. Ngwa lee otu ụgwọ ndị ọrụ gọọmenti Naịjirịa si tụnyere nke mba ndị ọzọ n'Afrika Lee otu ego ụgwo ọrụ opekeye mpe Naịjirịa si tunyere mba ndị ọzọ n'Afrịka Ebonyi Steeti Ka gọọmenti etiti nwelite ego a na enye gọọmenti steeti Onyeisi na-ahu maka mgbasa ozi na Ebonyi Steeti bụ Emmanuel Uzor ekwuola na Ebonyi steeti ga-akwu ma steeti ndị ọzọ bido kwụwa. Ọ na-ekwukwa ka gọọmenti etiti tinye anya n'ihe gbasara etu esi eke ego steeti. Ma ka gọọmenti etiti nwelite ego a na-enye gọọmenti steeti ka ọ zuo iji kwụọ ugwọ opekatampe a. Imo Steeti Gọvanọ Ikpeazu bu ọdị nma ndị ọrụ Imo steeti n'obi Chibuike Onyeukwu bụ onyeisi na-ahu maka mgbasa ozi n'Imo steeti kwuru na Gọvanọ Ikpeazu nwere ọ dị nma ndị ọrụ Imo steeti n'obi nke ukwuu. O kwuru na Govanọ Ikpeazu agaghị ekwe nkwa ihe ọ na agaghi emezu, kama na gọọmentị Imo ga etinye anya n'akwụkwọ ego steeti were nwee nzuka na etiti ha na ndị ọrụ Imo steeti ka ha mara otu ha ga esi gaa n'ihu maka ugwọ opekete mpe a. Lee ihe nkiri ga-amasi gi : New minimum wage: 'Ego ahụ enweghị ihe ọ ga-ezu'- Ndị ọrụ Akukọ ndị ga-amasi gị :" afirika-50614393,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50614393,World Aids Day 2019: HIV n'ọnụọgụgụ,"Ụbọchi mbụ nke ọnwa Disemba bụ ""World Aids Day"" - bụ oge e ji agbasa ozi maka agha a na-ebuso ọrịa a.","HIV ka na-aga n'ihu ịbụ nnukwu ihe na-enye ahụike nsogbu n'ụwa gbaa gburugburu. Ihe ruru mmadụ nde 32 anwụọla site n'ọrịa a kemgbe ọ malitere. Mana, ya bụrụ na ndị na-arịa ọrịa na-enweta ọgwụgwọ dị ire, ọrịa a ga-abụ ihe a na-ejikwatanwu ejikwata. Akụkọ ga-amasị gị:" 42960345,https://www.bbc.com/igbo/42960345,Magụ: EFCC chọkọtara ego karịrị N500BN na 2017,"Ibrahim Magụ kwuru na site na Jenụwarị ruo na Dịsemba n'afọ 2017, ndị ụlọ ọrụ ya chọpụtara ego karịrị ijeri narị anọ, iri asaa na atọ naira(N473 billion), nde dolla iri itoolu na asatọ ($98 million),","Magu kọwaputara ego ya ndị otu ya chọputara na arọ gara aga na Vienna. nde euro asaa (7million euro) na puku narị abụọ, iri itoolu na anọ pounds (294,000 pounds). O kwuru nke a ebe ya na ndị otu ya gara nyocha na nkọwa bọgetị ụlọ ọrụ ya nye ndị ụlọ ome iwu n'ahụ maka nyocha mpu ego. Magụ gwara ndị ome iwu na ụfọdụ ego ha chọputara na 2017 sonyere ijeri naira iri atọ na abụọ (32 billion naiira) nakwa ijeri ise dollars($5million) a hapụrụ government site n'aka Mịnịsta n'ahụbu maka mmanụ ụgbọala akpọrọ Dieziani Alison Madueke. Ndị ọzọ ahapụrụ bụ nde narị anọ na iri anọ na itoolu naira(N449 million) achọputara na ụlọ ahia dị na Legọs, ijerị naira narị atọ, iri abụọ na itoolu si n'aka ndị na tụ mgbere mmanụ ụgbọala na kano,ụfọdụ si kwa na ntuisi ewekọtara n'ụlọ akụ di iche iche. Magu si na owegarala ndị ụlọ ome iwu ya bụ nkọwaputa ego niile ya ndị otu ya chọputara." 42712250,https://www.bbc.com/igbo/42712250,Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu,Osote onye-isi ndị ome-iwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ike agwụla ndị Sịnatị iji otu nkeji darajụụ akwanyere ndị egburu n'ime oke ọgbaghara dị na Naịjirịa oge ọ bula.,"Ike ịda jụụ otụ nkeji banyere oke ogbugbu na-eme n'ala Naijiria agwụla Ekweremmadụ Ekweremadu katọrọ mwakpọ na ogbugbu ndị Naịjirịa aka ha dị ọcha nke ndị Fulani na-achị ehi mere, kwuo na ike agwụla ndị ome- iwu ịkwanyere ha ugwu n'otu nkeji' Cheta n'otu ịzụka gara-aga ka emere akwam ozu mmadụ ruru iri asaa egburu na Local Gọọmenti Logo na Guma nke Benue Steeti, e be ihe kariri mmadụ iri ise ka akụkọ kwuru n'egburu na Taraba Steeti. Ekweremadu gosiri iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na nzukọ ndị ome-iwu n'ụbọchị taa, kwuo na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nwe udo na nchekwa, tupu e kwuowa okwu iwulite obodo. Ọ sịrị: ""Ndị ome-iwu abụghị sọ ọsọ ndị ihe a metụtara, kama ndị Naịjirịa niile. 'Ike agwụla anyị iji otu nkeji dị jụụ maka nkwanye ugwu. Ihe anyị chọrọ bụ udo na nchekwa tupu echewa echịchị nwuli obodo.""" afirika-44113805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44113805,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Lee aha mmadụ 30 ga-asọ mpi iko mbaụwa,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,"Ogbunigwe si n'ime ala gbara n'ime ụlọụka Katọlik, Holy Cross dị n'obodo Iji-Nike dị n'Enugwu steeti. Ndị na-aka ụka ebe ahụ kwuru na ha nụrụ ụda ya tupu ụka ụtụtụ ebido mana obi ụtọ ha bụ na onweghị onye nwụrụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa Taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ nke afọ iri na ise nke Leah Sharibu bụ nwatakwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ n'obodo Dapchi. Cheta na ndị Boko Haram hapụrụ ụmụakwụkwọ ibe ya ruru otu narị ma jụ ịhapụ ya maka na ọ bụ onye ụka Kraịst. Na mba ofesi, Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla ka ndị mba Amerịka mepere ụlọ ọrụ nnọchiteanya ha na Jerusalem. Ihe ruru mmadụ iri anọ na atọ nwụrụ ebe ihe ruru puku abụọ na narị abụọ merụrụ ahụ ka ndị agha Israel lusoro ha ọgụ. N'egwuregwu, Ndị otu NFF ewepụtala aha mmadụ iri atọ ga-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa. Ndị dịka Kenneth Omeruo, Mikel, Iwobi, Victor Moses nakwa Kelechi Iheanacho bụ ndị akpọrọ aha. Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Na mkparịtaụka BBC na onye ọkpaọchị ama ama bụ Uche Ogbuagu o kwuru na ọrụ ya emela ka ụfọdụ ndị enyi ya gbahapụ ya. O kwukwara ihe o jiri gbaa arụkwaghị na gọọmenti Imo Steeti mgbe ọ rụrụ ọrụ ebe ahụ. Ihe Uche Ogbuagu huru mgbe ọrụọrụ na gọọmenti Imo Steeti" 42884850,https://www.bbc.com/igbo/42884850,Ọchịchị mba Amerịka: Trump arịọla maka udo na ịdịnaotu,Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emela mgbasa ozi nke mbụ gbasara etu ọchịchị Amerịka si aga kamgbe o were ọchịchị n'afọ 2017.,Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Trump site na mgbasa ozi ahụ o mere kwuru na ya na-enye ndị otu pati Demokrat ohere ka ha rụkọ ọrụ. Trump kwukwara na ya chọrọ ka ụlọmkpọrọ a na-akpọ Guantanamo Bay ghere oghe na-eweghachi iwu onye buburu onyeisiala Amerịka bụ Obama nyere ka emechie ya. Akụnaụba mba Amerịka na-arị elu mana ndị mmadụ anabataghị onyeisiala ha bụ Trump. 46441789,https://www.bbc.com/igbo/46441789,#NassProtest: Kwụọ anyị ụgwọọnwa - Ndịọrụ NASS,Bukola Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu na ogbo ya n'ụlọomeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara ekwela ndị ọrụ ụlọomeiwu nkwa na ha ga-agba mbọ inweta ego n'ụzọ ọzọ were kwụọ ha ụgwọ ndị e ji ha.,"Ndị na-arụ n'ụlọomeiwu mere ngagharịiwe taa bụ Tuzdena-eti mkpu ka a kwụọ ha ụgwọọnwa ndị e ji ha. Ha kwuru na ọ bụrụ na emezughi ihe ha na-achọ, na ha agaghị ekwe ka ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta nwee ọgbakọ ha. End of Twitter post, 1 Ha na-ekwu ka e wepụta akwụkwọ mbuli n'ọkwa nakwa inwere n'ọrụ ndị otu ha, ma kwụọkwa ha ụgwọ niile e ji ha. Ha kwuru na e meghị nke a, na ha ga-akwụsị ọrụ n'abalị iri na atọ nke ọnwa Disemba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42903946,https://www.bbc.com/igbo/42903946,Obi adighị IOC mma na mwepụ ewepụrụ mmachi e nyere ndị atleti Russia,"Kọmiti na-ahụ maka egwurekwu Olympics a na-akpọ, International Olympic Committee (IOC), ekwuola na mkpebi a nwere maka iwepụ mmachị ebighebi e mere ndị atleti iri abụọ na asatọ na Russia ga-emetụta ọdịnihu agha megidere ịṅụ ọgwụ ike.","Alexander Tretiakov nwetere medalụ olaedo n'egwuregwu ụmụnwoke na Sochị Ulọikpe n'ahụ maka egwuregwu dị iche iche akpọrọ Court of Arbitration for sport (CAS) na bekee wepụrụ mmachị IOC nyere maka ọgwụ ike n' asọmpị Olympics afọ 2014. CAS kwuru na n'ime ikpe iri asatọ onweghị ihe ọkpụrụkpụ gosiri na-eji ogwu ike eme egwuregwu. N'aka nke ọzọ, IOC kwuru na ọ ga-eche echiche maka arịrịọ ọ na-etinyere na Swiss Federal Tribunal. Kedu ihe kpatara e jiri machịe ndị atleti Russia? Mmadụ ruru iri anọ na atọ ndị Russia ka e nyere mmachi ebighebi iga Olympics maka nyocha IOC mere gbasara ngosi nkwado ndi steeti Russia nyere ọgwụ ike na Sochi na 2014. Mịnịsta n'ahụ maka sports na Russia akpọrọ Pavel Kolobkov kwuru, ""Mụ na ndị otu m na-enwe anwụri n'ikpe ziri ezi emeriela."" Ọ si na mkpebi a gosiri na aka ọtụtụ ndị e boro ebubo ịnwụ ọgwụ ike n'egwuregwu bụ atleti ọcha. Ndí ntaakụkọ Interfax sịrị na dịka onye isi Russian Olympic Committee bụ Alexander Zhukov si kwuo: ""Anyi na-enwe anwuri na ụlọikpe eweghachila ezigbo aha ndi atleti a ma nzere ha."" Gere ihe ndị mmadụ na-ekwu n'igwe okwu Twita:" media-55794726,https://www.bbc.com/igbo/media-55794726,Nigeria UFC: Etu m si bụrụ ọkaibe n'ịlụ ọgụ 'Martial arts' ka awụchara m 'acid' - Lovethpatra Young,LovethPatra Young abụrụla ọkaibe n'ọgụ Martial art na mba United States dịka awụchara ya 'acid' otu mgbe.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, LovethPatra Young kọọrọ etu esi gbahapụ ya tupu ọ bụrụ ugo na-achakezi ma n'ofesi. Akụko ya ga-akpalite mmụọ gị. Gere ya n'uju ebe a: Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Peter Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43068431,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43068431,Jacob Zuma etinyela akwụkwọ arụkwaghịm,"N'ozi oziri nke a gbasara n'onyonyo televishon, o kwuru na ya na-arịtu mana o kweghị n' okwu otu pati ya bụ ANC.","E boro Zuma ọtụtụ ebubo mmerụaka Ndị ANC gwara ya ka ọ rịtuo ,o meghị otu ahụ, ha ga-ewepụ ya site n'ụlọ omeiwu. Ọtụtụ akpọla oku ka nwa amadi a dị afọ iri asaa na ise rituo, ma nye ohere ka osote ya bụ Cyril Ramaphosa, bụrụ onye ndu ANC. E boro Zuma, onye banyere ọchịchị kemgbe afọ 2009, ọtụtụ ebubo mmerụaka. Ụbọchị Wenezde, ndị uweojii wakporo ụlọ ndị ezinaụlọ ama ama ma nwekwa ego bụ Gupta ndị ya na Zuma nwere ezigbo mmekọ n'ụlọ ha dị na Johannesburg." afirika-50186050,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50186050,Igboukwu Art: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu',"BBC Igbo gara gbaa ọkụ n'ime ụlọ nchekwa ihe nka (museum) nke Igboukwu dị n'Anambara steeti, nke bụ otu ebe njirimara ndị Igbo n'oge gboo.","Ọ bụ n'afọ 1960 ka e si n'ala gwupụta ọtụtụ ihe nka ndi a ndị mgbe gboo ji eme ọnụ. Mana ka ọ di ụgbu a, ọtụtụ ihe nka ndi a adịkwaghị n'ala Igbo. Ụfọdụ n'ime ha di n'ụlọ nchekwa ihe nka nke dị na Legos nakwa Jos, ebe ụfọdu bụ nke ndị ohi bịara zukọrọ. Lee ihe nkiri a ka ị hụ ihe anyị hụrụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44500328,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44500328,Onye ọkaiwu Evans esepụla aka n'ikpe ya,"Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Channels Tv sị kwuo , Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwu Chukwudumeme Onwuamadike ama dịka 'Evans' esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka.","Chukwudumeme Onwuamadike a.k.a Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a. Ka akwụkwọ ahụ si kwuo, ""Maranụ amara na anyị mere ihe ka o si kwesi n'agbanyeghị na a na-eyi ndụ m na ndụ ndị ọkaiwu m egwu maka ihe gbasara okwu a."" O kwukwara na ya na otu ndị ọkaịkpe ya jisike gosi iwu kwuru na ""aka mmadụ niile kwụ ọtọ rue mgbe ịkpe ga-ama ha"". Cheta na Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa. A ga-ebidokwa ikpe ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun bụ izuụka ọzọ na-abịa." afirika-44854532,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44854532,Oji otu ụkwụ agba egwu,"Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjira nwere ọrụsị na-eju n’okporoụzọ na-arịọ arịrịọ, mana Doris ekwenyeghi na nke a.","Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị esonye na ndi na-arịọ arịrịọ maka na Chukwu goziri ya. Doris kọwara na ọ bụ ọgba tum tum kụrụ ya oge ọ bụ nwata ma gbajie ya ụkwụ nke mere na ndị dibia Bekee kwuru ka e bee ya ụkwụ. O kwuru na ọ gbawara ya obi mana ya chọpụtara na ya bụ onye a goziri agozi maka na o nwere ndị enweghi ụkwụ maọbụ aka, mana ya nwere otu ụkwụ na aka abụọ. Doris si na olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama n’ihe nkiri site n’ime ihe onyonyo nakwa na ịgba egwu nke ụkwụ ya anaghịakwụsị ya ime. O mela ihe onyonyo ruru mkpụrụ anọ ebe ọ na-esonyekwa na ihe onyonyo egwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52430290,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52430290,Ihe mere m ji jiri ọja eto Chineke - Fada Chiadika Okolie,Ọja so na njirimara egwu Igbo.,"A na-adị ahụkarị ya ka ihe eji agọ mmụọ makana ọ na abụkarị ihe na-eso n'egwu mmọnwụ nakwa ihe eji eto dike. Mana, Fada Chiadika Okolie bụ ogbu ọja ma bụrụkwa onye ukọchukwu na ụka Katọlịk. Ọ na-agba mbọ ịhụ na akwụsịrị ịhụ ọja dịka ihe ọgọ mmụọ. Fada Okolie na-egbukarị ọja ya n'ime ụlọ ụka ma ya na-aka ụka. Ọ na-ejikwa ya eti mmọnwụ. Na mkparịtaụka, ọ kowara BBC Igbo ije ha na ihe mere ejizi eti mmọnwụ n'ụka. Ndị mere ihe onyonyo a: Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu. Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-54825121,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-54825121,US election 2020: Ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi onye ga-emeri na ntuliaka a?,Joe Biden nke 'Democrats' nọ n'ụzọ mmeri na ntuliaka Amerịka mana Onyeisiala Trump nke 'Republican' na-ama ngụkọ vootu na steeti anọ aka n'ụlọikpe. Kedụ ihe nwereike ime?,"Ndị na-akwado onyeisiala nọ na-eme ngagharịiwe na Michigan Otu achụnta vootu Trump na-enweghi akaebe kwuru na aghụghọ abaala na vootu ma na-achọ ịkwụsị ngụkọ vootu na Pennsylvania, Wisconsin, Georgia na Michigan. Anyị gbara onye ọkachamara n'iwu ajụjụ ihe ọ pụtara - na ihe ọzọ na-eso ya ma okwu a gaa n'ihu. Ọ bụ na anyị ekwesịghi ịma mpụtara ugbua? Eeh na mba. Na mbụ, ọ bụrụ na mpụtara gosiri na otu onye ọnụọgụgụ buru ezigbo ibu na-emeri, ụlọ mgbasaozi n'Amerịka na-akpọpụta otu onye ahụ dịka onye meriri. Nke a na-emekarị na mbido ụbọchị na-eso ụbọchị a tụchara vootu. Nke a abụghị mpụtara si n'aka gọọmentị, ọ bụghị mpụtara ikpeazụ- ọ bụ amụma, mpụtara si n'aka gọọmentị na-ewe ọtụtụ ụbọchị na ngụkọ. Mana etu e si tụọ vootu n'usoro nzipu ozi n'afọ a pụtara na ngụkọ ga-egbu ezigbo oge, ọkachasị nke a steetị ndị gbapụtara ihe ekweghi ka a gụkọọ vootu tupu ụbọchị ntuliaka. A gụkọọla ọtụtụ vootu mana ụzọ ka nwereike ịdị anya Ha kwesịrị ịgụkọ he niile n'ụbọchị ahụ, ma ị gụkọ vootu si nzipu ozi na-egbe oge karịa nke mmadụ bịara n'onwe ya tụọ n'ihi nyocha ndị a na-eme. Ọ bụrụ na ohere ha dị kpachikpachi mana o nweghi onye chọrọ ịnabata mmeri, ngụkọ ga-aga n'ihu dịka Mathew Weil bụ direktọ nke 'Bipartisan Policy Research Center' na-ahụ maka ntuliaka si kwuo. E nwere ọgbatauhie tupu ntuliaka amalite Ọ dị mbụ bụrụ ntuliaka na-eche ihu n'ụlọikpe. Tupu mbinyeaka amalite na Tusde, e nweela mkpesa karịrị 300 na steetị 44 banyere ịtụ vootu site na nzipu ozi nakwa ịtụ vootu ọsịsọ na ntulaiaka afọ a. Ha gbakwasịrị ụkwụ n'ụfọdụ okwu gụnyere ụbọchị akwụsịrị izipu na ịnabata vootu, ụdị ndị akaebe ga-etinyeaka n'akwụkwọ na akwụkwọ 'envelope' e ji zipu vootu ndị a. Steetị ndị 'Republican' na-achị sị na mmachi kwesịrị ịdị iji gbochie aghụghọ n'ịtụ vootu. Mana ndị 'Democrats' sị nke a bụ atụmatụ ịkpachi ikike dịrị onye n'ịtụ vootu. Kedụ ihe ịmaka n'ihu Trump nyere? Na Wisconsin Otu achụnta vootu onyeisiala sị na o kwuola ka a gụgharịa vootu na Wisconsin ""maka ihe edoghi anya"" mere na Tusde. O doghi anya mgbe a ga-agụgharị ya, mana ọ gaghị eme ruo mgbe ndị ọrụ ntuliaka ga-enyocha vootu ndị ahụ. Ụbọchị ikpeazụ nke a nwereike ime na steetị ahụ bụ na 17 Nọvemba. Ọkammụta ngalaba iwu na Mahadum Columbia bụ Richard Briffault kwuru na a gụgharịrị vootu na Wsconsin n'afọ 2016, na ""ọgbanwere ihe ruru vootu otu narị"". ""Ị gụgharị vootu abụghị ụzọ e ji akagbu vootu,""ọ kọwara. ""ọ bụ etu e ji eme ka o doo anya na mmehie adịghị na ngụkọ ahụ."" Na Michigan Trump ji obere ihe merie na steetị ahụ n'afọ 2016 - obere ihe karịrị vootu 10,700. N'ụbọchị 4 nke Nọvemba, otu achụnta vootu ya tinye mkpesa ka a kwụsị ngụkọ vootu ebe ahụ, na-agbanyeghi na ndị ọrụ ntuliaka agụkọchala vootu dị pasentị 96. E nwere ọtụtụ puku vootu a na-agụbeghi nke ọtụtụ n'ime ha si n'ebe ndị 'Democrats' gbara mgbọrọgwụ, mana ndị ntaakụkọ Amerịka na BBC na-ekwu na Biden nwereike imeri. Na Pennsylvania Nsogbu dị ebe a bụ na mkpebi steetị kpebiri ka a gụkọọ vootu ndị a tụrụ n'ụbọchị ntuliaka mana rute ha aka ka n'ihe ruru ụbọchị atọ gachara. Ndị Repọblikan na-achọ ịgbagha mkpebia n'ụlọikpe. Weil sị na ọ bụ nke a na-eche uche karịa dịka ụlọikpe kachasị na mba nọ n'ikpe ya tupu ntuliaka eruo - tupu ọkaikpe Amy Coney Barrett banye n'ọkwa. ""Ha kwuru na ha ga-achọ iwe ha ma e mecha. Echeghi m na a ga-ekpofu ụfọdụ vootu e zipuru n'ụbọchị ntulaiaka a na-ataghi ruo ụbọchị Fraịde"". Ọkammụta Briffault kwukwara na a ga-agụkọ vootu ndị abataghị n'oge iche, ma sị Biden nwereike ịnọ n'isi ma a gụghị ndị ahụ, ọ hụghị uru ọ bara ịga ụlọikpe. Mana ndị achụnta vootu Trump ekwupụtala mmeri na steetị ahụ na-agbanyeghi na e nwere vootu karịrị otu nde a gụbeghi. Na Georgia Ndị Repọblikan steetị a na otu achụnta vootu Trump mere mkpesa n'ụlọikpe Chatham County ka akwụsịtụ ngụkọ vootu, n'ebubo nsogbu dị n'enweghi usoro ịtụ vootu. Onyeisioche Repọblikan na Georgia bụ David Shafer dere na twitter na ndị na-ele ka ntuliaka si aga hụrụ ka otu nwaanyị wụkọtara vootu karịrị 50 n'ime igbe vootu ndị agụghị agụ maka ndị nwee ya anọghị"". Ha agwala ọkaikpe ka ọ chọpụta vootu ndị ahụ a nabatara mgbe e binyechara aka n'ụbọchị ntuliaka. O nwere ihe ga-eru n'ụlọikpe kachasị? N'isi ụtụtụ Wenezde, Trump kwuru na aghụghọ dị na-enweghi ihe akaebe, ọ sị kwara ""Anyị ga-aga n'ụlọikpe kachasị - anyị chọrọ ka mbinyeaka niile kwụsị."" Mbinyeka adịla na mbụ kwụsịla - ebe mbinyeaka emechie n'ụbọchị ntuliaka, na-agbanyeghi e nwere vootu na-abịaghị n'oge, dịka na Pennsylvania. Weil kwuru: ""Ụlọikpe kachasị enweghi ikike pụrụiche ọbụla igbochi ngụkọ vootu na-aga n'usoro iwu."" Ọkammụta Briffault kwuru ""Enweghi ọkọlọtọ usoro e ji ebute nsogbu ntuliaka n'ụlọikpe kachasị. O zighi ezi ma ọ ga-abụrịrị okwu ndị pụrụiche."" Ọ bụrụ na e wepụ mpụtara ntulaiaka n'ụlọikpe, otu ndị ọkaiwu ga-ama ya aka n'ụlọikpe steetị. Ndị ọkaikpe steetị ga-anabata mkpesa ma nye iwu sị ka a gụgharịa vootu, e nwereike ịsị ndị ọkaikpe ụlọikpe kachasị ka ha kpegharịa ikpe a. N'ụfọdụ ebe a na-agụgharị vootu ma ọ bụrụ na ihe ha ji akari ibe ha dị obere - i nwereike icheta Florida na ntuliaka 2000 n'etiti George W Bush na Al Gore. Oge ole ka o nwereike ifu? Maka na ihe a bụ ntuliaka onyeisiala, e nwere oge ọ na-ewe iji hụ na e mere ihe ndị a: Mana Weil sị na ""ọtụtụ ihe ga-emebi tupu o ruo n'ọnọdụ ebe ndị Nnọchịteanya na ndị Sịnetị ga-ekpebi onyeisiala na osote ya. Gịnị nwereike ime ka steetị ghara ịkpọpụta onye meriri? Ọ bụrụ kwanụ na steetị enweghi ike ikpebi onye ha ga-ahpụta? Tụlegodi ihe nwereike ịdapụta ma ọ bụrụ na otu pati sị na aghọrọ aghụghọ. Steetị bụ ọgbọ ọgụ dịka North Carolina, Pennsylvania, Michigan na Wisconsin nwere gọọmentị kewara ekewa - Ndị gọvanọ 'Democrats'na ndịome kachasị na Repọblikan. Na Steetị ndị a, ndị omeiwu nwereike ikewa site na gọvanọ ha ma nye ndị ha họpụtara iche n'ụlọomeiwu ( O mere n'afọ 1876). Ndị omeiwu ga-ekpebi onye a ga-ewe vootu ya - Ọ bụ gọvanọ nke gọvanọ wepụtara ka ọ bụ onye omeiwu. Ọ bụrụ na ndị nnọchiteanya na ndị sịnetị kwekọrịta, nsogbu adịghị. Ọ bụrụ ha kewaa, nsogbu dịkwa, na-agbanyeghi ndị ọkachamara sị n'iwu ọchịchị etiti na-akwado ndị gọvanọ họpụtara. Ụbọchị ikpeazụ, ikpeazụ. Ihe ọbụla na-emela, iwu bụ na a ga-enweriri onyeisiala n'ụbọchị na 20 Jenụwarị dịka iwu si dị.No matter what, on 20 January, the Constitution says there must be a new presidential term. ""N'ehihie anyị ga-edu mmadụ n'iyi ọrụ dịka onyeisiala, ọ bụrụ na isi apụtaghị, anyị abanye n'atụmatụ ọzọ,"" Weil kwuru. O kwuru na ọ bụrụ ndị nnọchiteanya ahọpụtaghị onyeisiala, ma ndị Sịnetị họpụta osote ya. Ọ bụrụ na ha emeghi nke a ruo ụbọchị idu n'iyi ọrụ, osote onyeisiala ahụ ndị Sịnetị họpụtara ga-abụzi onyeisiala. Onye na-eso ya ga-abụ osote onyeisiala - onyeisi ụlọ nnọchiteanya (Nancy Pelosi nke 'Democrats'nọ ugbua) Ụdị ihe aemetụla mbụ? Ruo ugbua, ọ bụ naanị ntuliaka afọ 2000 ka ụlọikpe kachasị kpebiri onyeisiala, mgbe George Bush meriri Al Gore.T Mgba ahụ siri ike n'etiti Gore nke 'Democrats' na Bush nke Republican. N'ụbọchị ntuliaka, Gore meriri na vootu a tụrụ atụ mana ọ rara ahụ na vootu si n'aka ndị kọleji. Ihe niile gbakwasịrị ụkwụ n'etu Florida si wepụta vootu dị 25 (electoral). Ntuliaka ahụ siri ike nke ndị otu Gore ji sị ka e were aka gụgharịa ya nke mere Bush ji gbagharịa ya n'ụloikpe. Dịka ọtụtụ izuụka gachara, ụlọikpe kachasị chabiri ikpe n'aha Bush. Gore nabatara ikpe a, nke mere Bush ji banye n'ọkwa. E nwere ọnọdụ abụọ ọzọ nwereike ịdapụta: Nkwekọrịta na ngwụcha ụbọchị, 1876 Ndị omeiwu nwere ntulaiaka ọzọ mebiri n'aka ha n'afọ 1876, n'etiti Samuel Tilden nke 'Democrats' na Rutherford Hayes nke 'Republican'. Ọ fọrọ otu vootu ka Tilden merie na ntuliaka kọleji. Steetị anọ nwere nghọtaghie na ntuliaka - ọ bụrụ na Hayes meriri ha, ọ ga-emeri ha niile. Ndị omeiwu kpọtara ụlọọrụ kwụ n'onwe ya ka o kpebie onye meriri. Nke wetara nkwekọrịta afọ 1877: Hayes ji otu vootu merie - site na nkwekọrịta ya na ndị 'Democrats'. Nke a mere ka ọ fọrọ ụbọchị abụọ ka e duo n'iyi ọrụ. Inwete vootu kachasị na ntuliaka kọleji ezughi, 1824 N'afọ 1824, nwoke meriri na ntuliaka ma kachasị nwete vootu na kọleji e merighi na ntuliaka. Ọ dịka Andrew Jackson ọ na-emeri John Quincy Adams n'ọkwa onyeisiala nke isii mana onweghi onye n'ime ha nwetere vootu kachasị, mkpe ahụ gaziri n'aka ndị omeiwu dịka iwu si dị. Onyeisi ụlọnnọchiteanya mgbe ahụ bụ Henry Clay, abụghị onye nkwado Jackson. N'ihe a kpọrọ ""ikwe ọnụ aghụghọ"", Clay na ndị ụlọnnọchiteanya nakwa Adams nwere nkwekọrịta ma nye Adams mmeri - nyezie Clay ọkwa odeakwụkwọ mba ha." afirika-45340406,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45340406,Theresa May na-abịa Nigeria izute Buhari taa,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Theresa May na-abịa Theresa May na Buhari zuteburu na UK n'ọnwa Epreelụ nke afọ a Theresa May bụ Praịm Mịnịsta ndị Briten ga-esi mba Saụt Afrịka bata Nigeria taa ebe ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-akpa maka azụmahịa, nchekwa nakwa ịgba mgbere mmadụ. Ipob Otu Ipob enyela iwu sị ka ndị Igbo niile na-akwado ha ghara ịpụta ezi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Septemba. Ha chọrọ iji ụbọchị ahụ ruo uju iji gosi iwe ha maka ndị ha sị nwụrụ n'egwu eke ndị agha Naịjirịa gbara n'Afaraukwu dị n'Ụmụahịa nakwa Ngwa, Aba na Port Harcourt, n'ụbọchị ahụ n'afọ gara aga. Gụọ ya n'uju ebea: Ipob sị Igbo apụtala n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba Ihe na-eme na Bornu Afọ na-achọ isagbu ndị mmadụ na Bọrọnu steeti. Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Haruna Mshelia kwuru na ihe karịrị mmadụ puku na-arịa ọrịa afọ ọsịsa, ebe mmadụ iri abụọ na ise nọ n'ụlọọgwụ maka ọrịa a si na mmiri ha na-an̄ụ. Gụọ ya n'uju ebea: Ọrịa afọ ọsịsa etipuola na Borno N'egwuregwu, Roger Federer meriri Yoshihito Nishioka iji banye n'agba nke abụọ n'asọmpi US Open, ebe Caroline Wozniacki meriri Sam Stosur iji gafee. Wozniacki bụ onye abụọ n'ọkwa onye kachasị apịa tenis na mbaụwa ebe Federer bụ onye abụọ n'ụmụnwoke kacha apịa. Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Atụmatụ nke gọọmenti etiti hiwere iji na-enye ndị ụwa na-atụ puku naịra ise kwa ọnwa ebirila ọkụ n'ebe ụfọdụ na Naijiria. Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye" afirika-55197896,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55197896,Amaghị m na isi nwa m ga-esi n'ahụ niile a wara ya pụta - Chinaecherem Okachukwu,"Chinaecherem Okachukwu bụ nne Miracle Zinachimdiebube Okachukwu, akọwaala ihe nwa ya gabigara n'ụlọọgwụ dịka a na-achọ ịzọ ya ndụ.","Zinachimdiebube bụ nwa a mụkworo amụkwo nke Bekee kpọrọ ""pre-term baby"", nke mere ka e jiri ngwaọrụ ahụike dị iche iche chekwaa ya oge a mụrụ ya, iji zọọ ndụ ya. Chinaecherem nne ya, gwara BBC Igbo na ọ maghị na isi nwa ya ga-emecha pụta dịka a wara ya ahụ ọtụtụ oge. Ọ kọwara etu ọbara mgbali elu na ""preeclampsia"" ọ rịara oge ọ dị ime Zinachimdiebube si mee ka a waa ya ahụ wee kupute ya ọsịsọ. A mụrụ Zinachimdiebube n'ọnwa asaa, ka ọ ha 0.75kg n'ibu. Lee ihe nkiri a ka ị nụ akụkọ a n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo." afirika-44384137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44384137,"Akwụkwọozi nwere ""Transmission"" akpala ṅdịomeiwu ọchị","Akwụkwọozi onyeisiala Muhammadu Buhari degara ndị ụlọomeiwu ukwu Naijiria banyere nhazigharị iwu ka a ga-esi na-eke ọrụngọ gbasara mmanụ dị n'ime okeosimiri na nke dị n'elu ala( Deep Offshore and Inland Basin Production Sharing Contracts Amendment bill) akpalitela ọchị na Sineti n'ihi okwu bekee, ""Transmission"" nke dị na ya.","Ndị ụlọomeiwu na onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim adịghị na mma nke na ha kwuru na ha enweghị ntụkwasa obi n'ime Idris Dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na-agụ akwụkwọozi ahụ, ya na ndị otu ya dapụrụ n'ọchị oge ọ gụpụtara ""Transmission""Buhari dere akpalitere ọchị n'ụlọmeiwu ukwu. O were nwa oge tupu Saraki tachie ma gbalikwa ịgụ akwụkwọozi ahụ ọzọ mana mgbaliya mere ka ọchị daa karịa. Akwụkwọozi ahụ nke isiokwu ya bụ ' Transmission of the Deep and Inland basin Production Sharing Contracts Amendment Bill 20118,"" bụ iji gwa ụlọomeiwu ka ha lebanye anya n'akwukwọiwu ahụ ma mee ya ka ọ bụrụ iwu. Cheta na nsonso a, otu ihe nkiri fegharịrị na soshal midia nke na-egosi ebe onyeisi ndị uweojii ala Naijiria bụ Ibrahim Idris na-ata ire ebe ọ na-agụpụta akwukwoozi ebe ọ na na-adọga ịkpọpụta okwu bekee, ""Transmission."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51780984,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51780984,Kidnapping: Aka ndị uweojii akparala onye so gbuo otu ụkọchukwu,Aka ndị uweojii n'Imo steeti akparala otu onye ntọ ha sị na aka ya dị n'ogbugbu ụkọchụ Cyriacus Onunkwo bụ onye ha naara ndụ n'afọ 2017.,"Aka ndị uweojii akparala onye gburu ụkọchụkwụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Olando Ikeokwu sị na aka kpaara ya bụ nwaamadị sagoro asịsa ka ọ na-agba nkwụ nwụye ọhụrụ ọ nụrụ n'Ajị dị n'Okpuru ọchịchị Oru East. Ọ sị na Charles Nnanna so na mmadụ isii tọọrọ ya bụ fada bụ onye bịara ịkwa nna ya nwụrụ anwụ n'afọ ahụ Dịka Ikeokwu kọrọ na ha chọpụtara na ya bụ ụkọchukwu nwụnahụrụ ha na-amaghị ama dịka ha kechiri ya imi na ọnụ ka ọ ghara itizi mkpụ n'ụzọ ka ha bụ ya aga. "" Ndị ntọ ahụ buuru ya banye imeọhịa ka ha kechie ya ọnụ ka ọ gharazị iti mkpụ, mgbe ahụ ka ha jiri kechikwuo ya ma ime mere fada ahụ ji nwụlahụ ha n'ụzọ"". Ikeokwu kwuru na Charles kọọrọ ha ka o sị gbaga Indonashịa bụ ebe ọ nọ ruo mgbe ọ latara ịgba nkwụ nwaanyị ya bụzị ebe aka nọzị kpara ya bụ ezekudele. Ọ sị na ndị uweojii jideburu mmadụ ise ndị nke ọzọ ka ha mechere ya bụ arụ. O kwukwara na ọ bụ ndị mgbaama ha nọ n'ime obodo gbaara ha ama maka nlọta ya bụ nwaamadị. Ikeokwu jikwa ohere ahụ kpọkuo ọha na Eze ka ha tinye aka n'ịgbara ndị uweojii ama ndị omekome bị na ogbe ha. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe Ndị uweojii na Delta na ndị ntọ Ọzọ dịka ibe ya bụrụ na aka ndị uweojii na Delta steeti kpakwara ndị otu ha mmadụ anọ aka ha dị na ịtọhapụ onye ntọ isiabaokpu ha ji eji. Onye kwuru nke a bụ onyeisi ndị uweojii na Delta steeti bụ Ikechukwu Aduba. Akwụkwọ akụkọ na-akọwa na ndị uweojii ahụ naara onye omekome ahụ ego ha ji tọhapụ ya ka ọ gbafụọ. Ndị uweojii ndị ntaakụkọ gbara ajụjụ ọnụ sị na ya bụ ihe ndị otu ha mere sigburu udele ma sigbuo nkakwụ. Ọgụ na-ada n'etiti Sọmalịa na Kenya N'Afrịka, ka ana ekwu ọzọ, ọzọ na-eme n'okeala Sọmalịa na Kenya dịka ọtụtụ mmadụ gbawara ọsọ ndụ ha maka ọgụ ndị agha mba abụọ ahụ na-alụ na Mandera dị na mpaghara ugwu mba Kenya. Nke a na-abịa otu ụbọchị ka Ndịsiala mba abụọ ahụ bụ Uhuru Kenyatta nke Kenya na Mohamed Abdullahi nke Sọmalịa nwechere mkparịta ụka maka ịme ka udo chịa n'etiti mba abụọ ahụ. Uhuru Kenyatta adọbụọla onyeisiala Sọmalịa aka na ntị maka ""ọgbaghara na-enweghị isi"" ha na-ebute. N'egwuregwu Sabio Mane gosiri ọkaibe n'asọmpi taa ebe o nyere otu goolu ma nyekwa aka na goolu nke ọzọ. Ụmụibe, n'asọmpị Premier League taa Liverpool ejirila ọkpụ goolu abụọ chụlaa Bournemouth be ha bụ ndị ji otu ọkpụ zọrọr isi onwe ha. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọdịghị mka ikpuchi imi na ọnụ gị ma ọ bụrụ na ahụ siri gị ike Mịnịsta nta na-ahụ maka ahụike bụ Olorunnimbe Mamora ekwuola na ọdịghị mkpa ndị mmadụ itụfụ ego ha n'ịzụ akwa mkpuchi imi beke kpọrọ face mask n'ihi egwu coronavirus. Mamora kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV n'ụtụtụ Satọdee. Ọ kọwara na ndị kwesịrị ị na-eji akwa ahụ ekpuchi imi bụ ndị ọrụahụike maọbụ ndị nwere ọrịa coronavirus, ọbụghị mmadụ niile. Mamora kọwara nke a n'ihi etu ndị na-ere 'face mask' ji bulie ọnụ egọ ya n'elu ọjị. Ndị ntaakụkọ kwuru na a na-erebu akwa mkpuchi imi otu puku naịra maka mkpụrụ iri ise, ugbua, ọ bụzị puku naịra iri maka mkpụrụ iri ise. Mịnịsta ahụ katọrọ etu ndị na-ere ihe ndị e ji egbochi ọrịa dịka akwa mkpuchi imi nakwa mmiri pụrụ iche e ji edobe aka ọcha bụ 'hand sanitizer' si bulie ọnụ ego ha n'ihi coronavirus. Ihu ụlọọgwụ etiti dị n'obodo Yaounde, Cameroon Mba Cameroon ekwuola na onye nke abụọ ebutela ọrịa coronavirus na obodo ha. Mịnịstrị ahụike Cameroon kwuru na onye nke abụọ a na onye nke mbụ mekọrịtara ahụ. Okwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha Mmadụ abụọ ahụ bu orịa a nọzị ugbua n'ụlọọgwụ etiti dị n'obodo Yaounde. Dkt Nanaouda Malachie bụ Mịnịsta ahụike nke mba Cameroon dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka obi ghara ịmapụ ha. Akwụkwọ ozi si n'aka mịnịstrị ahụike nke Cameroon Nke a na abịa dịka a chọpụtara na mmadụ atọ a na-enyo enyo maka ọrịa coronavirus na Naịjirịa ebughị ya bụ ọrịa. Ka ọ dị ugbua, naanị otu onye buterela coronavirus na Naịjirịa. Nwoke ahụ bu onye ọcha si mba ịtali bata. Na mba Itali Na mba Ịtali, a na-agba ọgwụ iji gbu nje n'ụlọụka dị icheiche. Na mba Ịtali, ọrịa coronavirus na-agbasa n'ike n'ike. O gbuola ihe ruru mmadụ narị abụọ dịka ndị ngalaba ahụike mba ahụ si kwuo. Ya bụ ọrịa abakwaala obodo Vatican, nke bụ ebe isi ụlọụka Katọlik dị. Na mba Iran a na-agba ọgwụ mgbochi nje n'ime ahịa Obodo ndị ọzọ ọrịa banyere n'ọdị nso a gunyere Serbia, Slovakia, Peru nakwa Togo. E wepụ mba China bụ ebe ọrịa coronavirus si malite, ya bụ ọrịa na-akpakwa ike na mba South Korea na Iran. Ọ bakwaala mba Amerịka nakwa Briten. Na California Ụgbọmmiri Grand Princess A chọpụtala ọrịa coronavirus n'ime mmadụ iri abụọ na otu nọ n'ụgbọmmiri a kpọrọ Grand Princess n'obodo California nke mba Amerịka. Ihe karịrị mmadụ puku atọ na narị ise nọ n'ime ụgbọ mmiri a. Osote onyeisiala Amerịka bụ Mike Pence kwuru na ụgbọmmiri ahụ ga-aga n'otue ebe dị anya ebe a ga-anọ nyochaa mmadụ niile nọ n'ime ya. Etu coronavirus si metụta egwuregwu A kagburu asọmpi gaara ịdị n'etiti PSG na Strasbourg n'ihi Coronavirus Coronavirus emeela ka a kagbuo ọtụtụ asọmpi na mba dị icheiche. N'abalị Satọdee, mba Fransị kagburu asọmpị bọọlụ gaara ịdị n'etiti ndị PSG na Strabourg n'ihi egwu ọrịa ahụ. Ha kagbukwara asọmpi ọsọ Paris Marathon nakwa asọmpi ịnya igwe a kpọrọ 'Paris-Nice Cycling'. Asọmpi EPL Alisson, Ochee bọọlụ ndị Liverpool, agaghị eso n'egwu taa n'ihi mmerụ ahụ Ọ bụ eziokwu na coronavirus abanyela mba Briten, mana ọdịbeghị oke njo ugbua. Ọrịa emeela ka a kagbuo ọtụtụ asọmpi na mba Ịtali nakwa Fransị, mana ọ dịghị otu a na mba UK. Otu egwu bọọlụ Liverpool na Bournemouth ga-amalite asọmpi English Premier League nke taa. Ebe Arsenal na West Ham ga-achịpụkwa ya n'elekere atọ nke ehihie a. Ụlọikpe mkpesa enweela onyeisi ọhụrụ Ọkaikpe Monica Dogban-Mesem Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Tanko Mohammed eduola Monica Dogban-Mesem n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọikpe mkpesa bụ 'Appeal Court' na Bekee. Dogban-Mesem bụbụ onyeisi ụlọikpe mkpesa dị n'Enugwu tupu onyeisiala Buhari ahọrọ ya n'ọkwa ọhụrụ a. E duru ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị Fraide n'ogige ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja. Ndị nọ n'emume idu n'iyi ọrụ a gụnyere ndị ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị, ndị ọkaikpe ụlọikpe mkpesa ndị ọzọ, nakwa gọvanọ Plateau na Kebbi Steeti bụ Simon Lalong na Atiku Bagudu. Dogban-Mesem bụ onye Plateau steeti. Ọ ga-anọchi anya Zainab Bulkachuwa bụ onye lara ezumike nka dịka ọ gbachara afọ iri asaa. Ikpe Maurice Iwu Maurice Iwu Ọkaikpe Nichola oweibo a kụchapụla arịrịọ Maurice Iwu rịọrọ ya ka e bufee ikpe gbasara ebubo nrụrụaka e boro ya si Legọs gaa Abuja. Gọọmentị etiti boro Maurice Iwu, onye bubu onyeisioche INEC, ebubo izupu ihe karịrị otu ijeri naịra na ụma. Iwu rịọrọ ka e bufee ikpe ahụ n'Abụja n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka o bi. Mana ọkaikpe Oweibo jụwapụrụ isi, kwuo na ọtụtụ ndị ga-agba akaebe na ya bụ ikpe bi na Legọs. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Historical Building: Ihe dị omimi maka ụlọ aja ụpa na-enye ndị Idumuje Ugboko ndo" afirika-43819566,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43819566,Nwaakwụkwọ OAU: Onyenkuzi kwadara m n'ule maka na ekweghị m,Nwaakwụkwọ Obafemi Awolowo University nọ n'okwu ebubo onyenkuzi chọrọ ịdina nwakwụkwụ ya iji kwalite ya ka ọ gafee n'ule agwala kọmitii na-enyocha okwu ahụ na Prof. Richard Akindele ma ama kwada ya n'ihi na ya jụrụ ime ihe o kwuru.,"OAU bụ madadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Okaiwu na-ekwuchitere nwata nwaanyị ahụ bụ Abiola Akinyode-Afolabi, kwupụtara nke a gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuusde ka ha pụctachara n'ọgbakọ nke kọmịtị ahụ hiwere n' ụlọ akwụkwọ ahụ. Na nsonso a, nwaakwụkwọ ahụ zipụrụ akụkọ dị n'igwe e ji amịta okwu (recorded audio) na soshal midia nke gosipụtara olu Akindele ka ọ na-amanye nwakwụkwọ ahụ ka ya na ya dina iji gafee ule. Akinyode-Afolabi gwara ndị ntaakụkọ na nwakwụkwọ ahụ kọrọ ya n'uju ihe mere n'etiti ya na onyenkuzi ya, na ya enweghị pasent 33 kama na ọ bụ maka na ya ekweghị ịdina onyekụzị ahụ mere o jiri kwada ya. Ọ gara n'ihu kwupụta na ya kpesara ndị nkuzi ndị ọzọ mana o nweghị ihe ha mere. Cheta na abalị ole na ole gara aga, mahadum OAU kwụsiri Akindele bụ onyenkuzi na ngalaba nlekọta na ọnụgụgụ nke a kpọrọ Management and Accounting Department na bekee, iji nye ohere ka e meecha nnyocha zuru oke banyere ebubo na ọ gwara nwaakwụkwọ ya dịna ya iji gafee ule. Kemgbe akụkọ ahụ na-efegharị, Akindele enyebeghị ọsịsa ọbula nnye ọha na eze. Umụakwụkwọ OAU na-ekwu na Akindele na-akpabu ụdí akwa mbụ Akụkọ ga-amasị gị:" 47705954,https://www.bbc.com/igbo/47705954,Ifeanyi Ubah: Ọ pụtala ihe?,Kepukepu a na-anụ maka Ifeanyi Uba bụ onye chịrị ọkọlọtọ YPP baa Sinet n'Anambra steeti apụtabeghi ihe n'ihi na o nwebeghi onye pụtara kpọmkwem sị na ha ahụla ihe ngosi okwu na-efegharị na o sila YPP pụga APC.,"Ifeanyi Uba End of Twitter post, 1 BBC Igbo kpọrọ onyeisi oche ndị YPP n'Anambra; bụ Prince Moses Obi, Senator Victor Umeh, Sinatọ ndị Anambra Sentral (Anambra Central Senatorial District) nakwa Emeka Ibe bụ onyeisioche ndị APC n'Anambra, mana ha niile sị na ha anụbeghi maka okwu a. Ifeanyi Uba bụ onye ji ego achụ nta ego ejiri ụlọọrụ Capital Oil mara. Amụrụ ya na Septemba n'afọ 1971. Ọ bụ ọkpara n'ime ụmụ asaa nna ha mụrụ. Ya amụọkwa ụmụ ise Ọ gụchaghị akwụkwọ maka na nna ya na nne ya enweghị ego iji zụọ ya. Mana ọ gara ọzụzụ dị icheiche mgbe ego batawara. Ifeanyi bidoro Capital Oil n'afọ 2001. Ọ bụkwa ya nwe Ifeanyi Ubah F.C. , nke na-azabụ Gabros International Footbal Club bụ nke so na-egwu bọọlụ Premiere league Naịjirịa. Ifeanyi Ubah zọburu ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'afọ 2014 na Labour Pati. Na 2019 Ifeanyi so zoo ọkwa Sinate maka ịnọchite anya Anambra South Senitorial zone na pati YPP. Inec kpọpụtara ya dị ka onye meriri ya bụ ntulika 2019 maka ịnọchite anya ndị ọgbọnta vootu ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44584202,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44584202,Osite Yoroba siri onugbu,Kolawole Dosunmu a ma dịka 'KD Prime' bụ nwoke ị sị nrị na-amasị.,O siere BBC Igbo ofe onugbu pụrụiche ya bụ nke ejighị 'Maggi' na obere mmanụ nrị were sie. Akụkọ ga-amasị gị: Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo afirika-43319890,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43319890,Anambra: Obiano achụọla kọmishọna ruru 18,Gọọmenti Anambara steeti emela nchịgharị na ndị ime kọmishọna ha dịka aka na-achị ha bụ Willie Obiano chụrụ ndị kọmishọna mmadụ iri na asatọ taa.,"Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ N'akwụkwọ ozi onye ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Solo Chukwulobelu binyere aka, ọ nyere ndị niile nchịgharị a metụtara ka ha nyefe ihe niile ha kwesiri inyefe n'aka ndị isi ụlọọrụ ebe ha na-arụ. Akwụkwọ ahụ kwukwara ka ha nyefe ụgbọala nakwa ọrụ niile ha ndị ọzọ bụ nke gọọmenti ha ji tupu ụbọchị 16 ọnwa Maachị afọ a bụ 2018. Otu onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Obiano bụ Oliver Okpala kwuru na ihe Obiano mere dị mkpa iji bido ọchịchị ọhụrụ na steeti ahụ. Cheta na Obiano meriri na ntuliaka ha mere we buru gọvanọ steeti ahụ nke ugboro abụọ. Anyị ga na-ewetara gị akụkọ ka ọ na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45812576,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812576,Akụkọ kachasị tata: Usain Bolt na-egbuke ka ọkụ n'otu bọọlụ ya,Usain Bolt na-egbuke ka ọkụ n'otu ya,"N'Egwuregwu, Usain Bolt enyeela ọkpụ abụọ n'ime asọmpi eyin na eyin otu ya bụ Central Coast Mariners na Macarthur South West gbara. Usain Bolt bụ nwoke ama ama na-efe ọsọ dịka nwamba n'ọhịa turu ọtụtụ ugo n'egwuregwu ọsọike dị iche iche. Atiku ahọpụtala onye ga-eso ya n'osọ ntuliaka 2019 Akukọ putara ugbua bụ na Onye chiburu dịka gọvanọ Anambra Steeti bụ Peter obi ga-eso ọkọlọtọ otu PDP bụ Atiku Abubakar na n'ọsọ ntuliaka 2019 dịka osote onyeisiala. Orji Kalu nwere oku n'ụlọikpe etiti Ụlọikpe etiti n'Abuja ekpebiela ka onye bubu gọvanọ Abia steeti bụ Orji Kalu za ajụjụ gbasara ebe Nnamdi Kanu nọ. Ụlọikpe a kpebiri na Orji Kalu ga-abịa za ajụjụ n'ụbọchị iri na anọ n'ịme ọnwa Novemba makana o kwuru n'ime ọnwa garaaga na Nnamdi Kalu nọrọ London. Akwa na-akpọtụ na mba Uganda N'Africa, nnukwu ide apiti egbuola mmadụ iri atọ na mba Uganda. Mberede a mere maka nnukwu mmiri zoro n'obodo ahụ mee ka otu oshimmiri hufere n'obodo ahụ. Gee nkeji BBC Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke Ndị agha Naịjirịa akụọla nwata akwụkwọ ihe Ndí agha Naíjiría Ndị agha Naịjịrịa akụọla otu nwaakwụkwọ ihe tinka kụru pan na Command Day Secondary school dị n'Enugu. Chioma:Gideon Oguguo bụ onye gbara afọ iri na ise eyizughị uwe akwụkwọ were bịa akwụkwọ ụbọchị Tuzde. Onye etinyele aka n'ụdọ na idi na-otu Naịjirịa Muhammadu Buhari na-ekwusi ike na ya na-anuso mpụ agha Onyeisiala Buhari adọọla aka na ntị nye onye ọbụla ji udo na ịdịnaotu Naịjirịa tie epele. Buhari kwuru nke a mgbe ọ nabatara Eze Abdulfatah Emetumah III nke Umuofor Oguta Imo Steeti n'obi ya n'Abuja ụbọchị Tọzde. Church arịọla Mgbaghara Uka katọlik N'ofesi, nwokorobịa ụkọ chukwu metọrọ na mba Saụt Afrika kemgbe 1980 a nabatala arịrịọ arịọrọ ya. Chioma:William Segodisho sị na obi ederela ya jụụ ugbua agbanyeghị na ọteela ya gbawara mbọ ịmata ka ụwa aga anụ onu ya. Real Madrid sị na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ụlọikpe N'egwuruegwu, otu egwu bọlụ Real Madrid ekwuola na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ahụ ụlọikpe bụ nke kwụru na ọ bụ ha gwara Ronaldo ya ekwela Kathryn Mayorga gbaa ya na anwụ. Mayorga na-ebo Ronaldo na ọ wakporo ya na hotel dị na Las Vegas n'afọ 2009 mgbe ọ ka na-agbara Real Madrid. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa APGA: Ndị Imo tunyere pati APGA na ntuliaka 2019 Akụkọ ga-amasị gị NLC: Anyị ekweghị na puku naira iri abụọ na anọ Zamfara primaries: Anyị nwere ndi ga-azo ọchịchị - APC" egwuregwu-44984100,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44984100,Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego,"Onye ntaakụkọ mba Gana bụ Anas Aremayaw Anas, bụ onye nyere BBC Africa Eye ihe onyonyo nke gosịrị onye nchịkọta Super Eagles, bụ onye a na akwụ nde naira atọ kwa ọnwa ka ọ na-anara ego ka e nwechara mkparịtaụka maka ịhọrọ onye ọgba-bọọlụ.","Ọ bụ otu n’ime ndị nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria a na-anụ aha ha,dịka o durula otu Super Eagles gaa asompi mba nọ n’Afrịka nke gara ọfụma nke ha ruru mgbacha ya nke mere n’afọ 2018. Ọ nọkwa ya n’oge asompi iko mbaụwa ma ga edukwa ha ga asompi olimpik nke 2020. Dịka ọdị ugbu a, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF amalitela inyocha ihe banyere akụkọ ị naara ego a nke Yusuf naara. Onye kwuru nke bụ Diretọ na-ahụ maka mgbasa ozi NFF bụ Ademola Olajire. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50072665,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50072665,BBC 100 Women 2019: Kedu ndị aha ha so?,BBC eweputala aha ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'ụwa niile gburugburu n'afọ 2019.,"N'afọ a ka ụmụnwaanyị 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu? Aha ndị a gụnyere onye na-ese ụlọ chọrọ irụgharị mba Syria, Onye na edu ndị na-arụ ụgbọelu ga aga ụwa Mars na Nasa, ọtụtụ ụmụnwaanyị ndi edeputara aha ha bụ ndị ọkamụta n'ọrụ ha, Ha ga-akọwara anyi etu ha chere n'ụwa ga adi n'afọ 2030. Ndị ọzọ gụnyere onye ndọrọndọrọ ọchichị 'ana amaghi' na emegide ndi otu nzuzo 'Mafia', ma kwa ndị na-agba bọọlụ na alụso ikpa oke maka na ha bụ ụmụnwaanyị, ndi a niile ji ndu ha egosi ndị ọzọ ụzọ . Ụmụnwaanyị bụ ndị Afrịka aha ha so bụ 9) Rida Al Tubuly - Onye na-achọ udo, Libya Dịka ọgbaaghara di na mba Libya, otu nwaanyị bụ Rida Al Tubuly na-achọ ka enye ụmụnwaanyị ohere ka ha soro n'ọchịchị ya bụ obodo ka ha nwee ike dozie obodo Libya. Otu ya bụ 'Together We Build It' na-achọ ụzọ i si dozie ma kwụsi ọgbaaghara na mba Libya. N'afọ gara aga ka ọ gwara ndị na-ahụ maka ikike dịịri onye nke ndị UN na ha anaghị etinye ụmunwaanyị na nzụkọ gbasara ọdinihu Libya. Tubuly bụ onye nkụzi na mahadum ma nwee kwa ntụrụụgo nke agụmakwụkwo ' International Human Rights Law'. 16) Judith Bakirya - Onye ọrụ ugbo, Uganda Judith Bakirya bụ onye eji ọrụ ugbo zụọ bụ onye mbu n'ime ndị ebiri ya nwetara ntụrụugo ị ga-akwụkwọ sekọndịrị na-efu. Mba Uganda nyere ya ntụrụụgo nke ọrụ ugbo. O ji ohere a ekwusi okwu ike maka inye ụmụnwaanyị ikike ruru ha nke gụnyere inwe ala, ịgụ akwụkwọ na ikwusi imegbu ụmụnwaanyị n'ezinụlọ. 27) Salwa Eid Naser - Ọgba ọsọ, Nigeria/Bahrain Salwa Eid Naser meriri 400 metres na Doha n'afọ a. A mụru ya n'Anambra steeti kama ọ gara mba Bahrain dịka ọ na-achọ ebe ọ ga-enweta ohere ito dịka onye na-agba ọsọ. 28) Rana el Kaliouby- Onye na-arụ kọmpụta na-eme ka mmadu, Egypt Rana el Kaliouby so na ndị mbụ bidoro rụwa igwe kọmputa na-eme ka mmadu n'Egypt. Ihe na-amasi ya bụ ihụ na ụmụnwaanyị nwetere ohere ụmụnwoke na-enweta na Teknụzụ. 30) Lucinda Evans - Onye na azọchitere ụmụnwaanyị oke ruru ha, South Africa. Evans na-agba mbo ihu na ụmụnwaanyi South Africa nwetere ikike ruru ha na-agbanyeghi na mwakpo na ogbugbu ụmụnwaanyi na-ari elu na South Africa 42) Asmaa James- Onye Ntaakụkọ/Onye na-akwalite ọdịmma, Sierra Leone James na ekwuchitere ndị na enweghi etu ọha ha na Sierra Leone. Ọ mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ na-eyi uwe ojii iji na ụbọchị Tuzde nke ikpeazụ n'ọnwa niile dịka ụzọ ha si ekwu na ha achọghizi mwakpo ụmụaka ụmụnwaanyị. Ihe kpaliri mụọ ya bụ mwakpo awakporo nwatakịrị dị afọ ise. 45) Gada Kadoda- Injinịa, Sudan Dr Gada Kadoda na-ekuziri ụmunwaanyi bi na ime obodo etu ha ga esi were anwu adobata ọkụ latrik n'obodo ha. 47) Ahlam Khudr - Onyeisi ndị na-eme ngagharịiwe, Sudan Onye bara onwe ya ' Nne ndị Sụdan niile nwụrụ maka ihe ha kwenyere', Egburu nwa Ahlam nwoke gbara afọ iri na asaa n'afọ 2013 mgbe a na-eme ngagharịiwe udo. Kamgbe ahụ ka Ahlam wepụtara ndụ ya ịchọ ikpe ziri ezi maka ọnwụ nwa ya na kwa ịkwado ikike ruru ndị niile nwụrụ maọbụ ndị 'furu efu' na mba Sụdan. 55) Julie Makani - Dọkinta na onye sayencị, Tanzania Julie etinyela afo iri na abụo iji chọpụta etu a ga esi agwọ ọrịa 'Sickel cell' ma na arụkwa ọrụ iji hụ na ndi mmadụ chọpụtara maka ọrịa ahụ. 61) Raja Meziane - Ọgụụ egwu, Algeria Raja Meziane na eji egwu egosipụta mpu na nrụrụaka di n'ọchịchị mba ya. 96) Purity Wako - Onye ọzụzu maka ndụ , Uganda Purity na-gba mbọ ihu na ụmụnwaanyị nwere ikike ruru ha n'ezinulo. 63) Benedicte Mundele - Onye na-azụ ahia nrị, Democratic Republic of Congo O mepụtara ọtụtụ nrị sitere n'ime ji bekee na 'Passion Fruit' nke ndị ogbenye ga azụtanwụ. 69) Farida Osman - Onye na-egwu mmiri, Egypt Ọ na ekwusi okwu ike ka ụmụakwụkwọ mahadụm tinye ụchụ n'ịgwu mmiri. Osmann ritere ọla nchara n'igwu mmiri n'afọ a. 81) Nanjira Sambuli - Onye na-ahu maka ụmụnwaanyị i so na Teknụzụ Dijital, Kenya Sambuli na-agba mbo ihụta na ụmụnwaanyị niile na mba Kenya nwere ike inweta ịntaneti. 83) Hayfa Sdiri - Entrepreneur, Tunisia Mgbe ọ dị afo iri na isii ka o wepụtara ụlooru na abụghi maka ikpa ego bụ 'Entr@crush' ebe ndị ntoroọbia ga enwe ike inweta nkwado ma gụọ akwụkwọ n'ihe dị ka 'management' na 'accounting'. O sokwara ndị UN rụọ ọrụ n'ihe gbasara oghata ọha na-ebe nwoke na nwaanyị. 90) Kalista Sy - Onye na-ede ma na eme ihe ejiji, Senegal Ihe ejiji ọmepụtara nke akpọrọ 'Mistress of a married man' wuru ewu n'obodo ha. Ihe ejiji a gosiri ụmụnwanyị na-eme ọfụma ma gosikwa nsogbu ndị lụru ọtụtu nwaanyị na ọrịa ụbụrụ . Ụmụnwaanyị ndị ọzọ so na abụghị ndị Afrịka 1) Precious Adams- Ote Egwu, US 2) Parveena Ahanger - Ikike ruru onye, Indian-administered Kashmir 3) Piera Aiello - Ndorondoro ochichị, Italy 4) Jasmin Akter - onye egwuregwu Cricket, UK/Bangladesh 5) Manal AlDowayan - Nka, Saudi Arabia 6) Kimia Alizadeh - Taekwondo , Iran 7) Marwa Al-Sabouni- Architect, Syria 8) Alanoud Alsharekh - Ikike ruru ụmunwanyị, Kuwai 10) Tabata Amaral - Ndorondoro ochichị, Brazil 11) Yalitza Aparicio - Onye ihe ejiji , Mexico 12) Dayna Ash - Omenala, Lebanon 13) Dina Asher-Smith - Atọgbaọsọ, UK 14) MiMi Aung - 'Project manager' na Nasa', US 15) Nisha Ayub - 'Transgender rights activist', Malaysia 17) Ayah Bdeir - Onye azụmahia, Lebanon 18) Dhammananda Bhikkhuni - 'Monk', Thailand 19) Mabel Bianco - Dọkinta, Argentina 20) Raya Bidshahri - Nkụzi, Iran 21) Katie Bouman - Sayence, US 22)Sinead Burke - Ikike diiri ndi meruru ahụ, Ireland 23) Lisa Campo-Engelstein - 'Bioethicist', US 24) Scarlett Curtis - Ode akwukwo, UK 25) Ella Daish - 'Environmentalist', UK 26) Sharan Dhaliwal - Ode akwụkwọ, UK 29) Maria Fernanda Espinosa -OnyeisiUN General Assembly, Ecuador 31) Sister Gerard Fernandez- Roman Catholic nun, Singapore 32) Bethany Firth - 'Paralympic swimmer', UK 33) Owl Fisher - Onye ntaakụkọ, Iceland 34) Shelly-Ann Fraser-Pryce - Ọgba ọso, Jamaica 35) Zarifa Ghafari - 'Mayor', Afghanistan 36) Jalila Haider - Okaikpe, Pakistan 37) Tayla Harris - Australian rules footballer and boxer, Australia 38) Hollie - Trafficking survivor, US 39) Huang Wensi- Oti okpo, China 40) Luchita Hurtado - Nka, Venezuela 41) Yumi Ishikawa - Onye bidoro #kutoo movement, Japan 43) Aranya Johar - 'Poet', India 44) Katrina Johnston-Zimmerman - 'Anthropologist', US 46) Amy Karle - 'Bioartist', US 48) Fiona Kolbinger - Onya inyinya igwe, Germany 50) Aïssata Lam - 'Microfinance expert', Mauritania 51) Soo JungLee - 'Forensic psychologist', South Korea 52) Fei-Fei Li - Igwe na-eme ka mmadụ, US 53) Erika Lust- Ejiji, Sweden 54) Lauren Mahon - Onye meriri ọrịa kansa, UK 56) Lisa Mandemaker - 'Speculative designer', Netherlands 57) Jamie Margolin - 'Climate change activist', US 58) Francia Márquez - 'Environmentalist', Colombia 59) Gina Martin - 'Campaigner', UK 60) Sarah Martins Da Silva - 'Consultant gynaecologist/obstetrician', UK 62) Susmita Mohanty - 'Space entrepreneur', India 64) Subhalakshmi Nandi - 'Ikike ruru ụmụnwaanyị, India 65) Trang Nguyen - 'Conservationist', Vietnam 66) Van Thi Nguyen - Onye nwe ulooru na 'disability rights advocate', Vietnam 67) Natasha Noel- Yoga , India 68) Alexandria Ocasio-Cortez - Nwaanyi omeiwu, US 70) Ashcharya Peiris - 'Designer', Sri Lanka 71) Danit Peleg- 'Designer', Israel 72)Autumn Peltier - Maka miri dị ọcha, Canada 73) Swietenia Puspa Lestari - 'Diver/environmentalist', Indonesia 74)Megan Rapinoe -Onye egwu bọolụ, US 75)Onjali Rauf - Ode akwụkwo, UK 76) Charlene Ren - Mmrir di ọcha, China 77) Maria Ressa- Ntaakụko, Philippines 78) Djamila Ribeiro - Ode akwụkwo, Brazil 79) Jawahir Roble - Onye na-egbu eguregwu bọọlụ, UK/Somalia 80) Najat Saliba - Okammuta Kemistirị, Lebanon 81) Nanjira Sambuli - 'Digital equality expert', Kenya 82) Zehra Sayers - Sayencs, Turkey 84) Noor Shaker - Sayensi nke Komputa, Syria 85) Bonita Sharma - Onye mmeputa, Nepal 86) Vandana Shiva - 'Environmentalist', India 87) Pragati Singh - Dọkinta, India 88) Lyubov Sobol - Okaikpe, Russia 89) Samah Subay - okaikpe, Yemen 91) Bella Thorne - Onye Ejiji, US 92) Veronique Thouvenot - Dokinta, Chile 93) Greta Thunberg - 'Climate change activist', Sweden 94) Paola Villarreal - 'Computer programmer', Mexico 95) Ida Vitale - 'Poet', Uruguay 97) Marilyn Waring - 'Economist and environmentalist', New Zealand 98) Amy Webb - 'Futurist', US 99) Sara Wesslin - Nkaakụko, Finland 100) Gina Zurlo - Ọmụmụ ofufe, US Photo credits: Photo copyrights: Karolina Kuras, Hans Jørgen Brun, Nicola Virzì, Sage Sohier, Christian Petersen/Getty Images, Mooreyameen Mohamad, Amelia Allen, Getty Images/Maja Hitij, UN, British Swimming, Hauser & Wirth, Oresti, Tsonopoulos, Kawori Inbe, Amal Adam, Matt Kay, Constanza Lavagna, Paula Mitre, Theo Kruse, Venura Chandramalitha, Luis Crispino/Claudia Magazine, Anders Hellberg, Graciela Buffanti, Wakophotography, IBF China, Germana Costanza Lavagna, Neal Hardie, Sharon Kilgannon, Hanna Sotelo, Sumit Kumar Singh, Päivi Mäkelä, Pimienta Films, Siddharth Das, Venura Chandramalitha, Linda Roy by Irevaphotography Gịni ka ụmunwaanyị 100 pụtara? BBC ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'afo obụla ma kọọ akụko ha. N'afọ a ka ụmụnwanyi 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu? Soro anyi na Facebook, Instagram na Twitter ma cheta were #100Women." afirika-48037023,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48037023,Ngozi Nwosu: Ihe ise ị ga-eme iji nwee ugwu n'ọrụ ihe nkiri,Ngozi Nwosu bụ onye ama ama na Naịjirịa ma mba ofesi maka ihe nkiri Nollywood.,"Ụfọdụ na-akpọ ya 'Ije Kpoms', ụfọdụ ma ya dịka 'Madam V-Boot,' ebe ndị ọzọ ma ya dịka 'Madam Peace.' Lee ndụmọdụ onye nyere ọbụla ọ na-agụ agụ ịchake na Nollywood Gee ya n'uju ebe a." afirika-50010608,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50010608,Super Eagles: Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF,Ụgwọ anyị ji Rohr bụ naanị otu ọnwa:,"Akụkọ dị mkpa: Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigerian Football Federation' ekwuola na ha ji onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ụgwọ otu ọnwa (Seputemba). N'ozi si n'akara twitter ha pụta sị na ọ bụ naanị ọbụghị ụgwọ ọnwa atọ dịka akụkọ na-efegharị si kwuo. Otu NFF gara n'ihu kwuo na ha na-agba mbọ ịhụ na a kwụrụ Gernot Rohr ụgwọ a n'egbughi oge 'Anyị chọrọ iwu kajara akaja make ikpuchi ụmụnwaanyị' Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na Naịjirịa chọrọ iwu siri ike iji megide mmegbu na mwakpo ụmụnwaanyị na ala. Onyeisiala Buhari kwuru nke a n'ime ụbọchị anọ BBC wepụtara akụkọ nyocha gosiri ndị nkuzi na mpaghara Afrịka na-achọ idina ụmụakwụkwọ. Ọka mmụta Boniface Igbenehue Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa nakwa ndịisi ụlọakwụkwọ ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na a tara ndị na-awakpo ụmụnwaanyị ahụhụ dịrị ha. Ọ sịrị ka ndị mmadụ ghara ịkọ ndị a wakporo ọnụ ma ọ bụ ime ha ihe ihere nakwa ka ezinaụlọ ndị a kwupụta ụdị ọnọdụ a. Nke a bụ okwu mbụ Buhari na-ekwu banyere ụdị ọnọdụ a. Nobel Peace Prize nke afọ 2019 E chiela Abiy Ahmad bụ Praịm mịnịsta mba Ethiopia eze udo nke mbụ dịka o turuugo nrite Nobel Peace Price nke afọ 2019 Echichi a bụ maka mbọ ọ gbara n'ime udo n'etiti mba Ethiopa na Eritrea n'ime ọgbaghaara ruru afọ iri abụọ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Kpochapụ mpụ na ohi n'Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obiano na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Aka na-achị Anambra Steeti bụ Willie Obiano adọọla ndị ekperima aka na ntị ka ha gbaara steeti ahụ ọsọ. Obiano kwuru nke a oge o mepere atụmatụ 'Operation kpochapụ nke abụọ n'ụbọchị Fraịdee. O kwuru na oge agaala mgbe ndị abalịdịehwu na ndị omekome ji Anambara mere ebe obibi. Iji mepee ya bụ atụmatụ, Obiano bunyere ndị uweojii ụgbọala dị otu narị na iri n'otu (111). Ụfọdụ n'ime ụgbọala ndị ahụ bụ nke Innoson Motors mepụtara ebe ụfọdụ si ofesi. Ụgbọala Gọvanọ Obiano bunyere ndị uweojii Obiano kwukwara na etinyela igwe ose foto Bekee kpọrọ CCTV na mpaghara dị iche iche na Ọnịcha, Ọka nakwa Nnewi. N'okwu ya, ""igwe ose foto ndị na-ahụ ụzọ ruo ihe karịrị ama egwuregwu bọọlụ anọ"". ""CCTV ndị ahụ nwekwara ike iseta mmadụ ma n'ime abali."" ""Ụgbọala ndị ahụ nwekwara akụrụngwa dị icheiche n'ime ha nke ga-enye aka inwude ndị ekperima n'otu ntabi anya."" Buhari ekeleela onyeisiala mba Ethiopia Onyeisiala Muhammadu buhari eburula ụkpa ekele bugara onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed. Nke a bụ maka nzere 'Nobel Peace prize' bụ nke e nyere Ahmed n'ụbọchị Fraịdee Ahmed ritere nzere a n'ihi mkpezi udo o wetara n'etiti mba Ethiopia na Eritrea. Buhari kwuru na ọ ga-amagbu onwe ya ma mba Afrịka niile bụrụ ndị na-achọ maka udo. Naịjirịa na P&ID Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Gọọmentị etiti akwụọla ụlọọrụ P&ID ego dị pound puku narị abụọ na puku iri ise (£250,000) dịka ụlọikpe na London si nye iwu. Mana onye ọkaiwu nke Naịjirịa bụ Dayo Akpata gwara ndị ntaakụkọ na a ga-akwụghachi Naịjirịa ego ahụ ma ha merie ya bụ ikpe. Naịjirịa ka na-agba lịkalịka ịtụgharị ikpe ekpebiri na London n'oge gara aga nke na-ekwu ka ha kwụọ ụlọọrụ P&ID ijeri dọla itoolu na ụma isii n'ihi nnupu isi na nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2010. Na Liberia Onyeisiala Liberia bú George Weah Ndị uweojii mba Liberia emechiela ụlọọrụ ntaakụkọ redio a kpọrọ roots FM n'ike n'ihi ebubo na ha enweghị akwụkwọ ikike. Ndị nwe ụlọọrụ ahụ kwuru na ha nwere akwụkwọ ikike kama na mmechi ahụ bụ maka na ha na-akatọ ọchịchị aka ike onyeisiala George Weah. Belgium alaferela Lukaku enyela goolu anọ n'asọmpi atọ ọ gbaara ndị Beljum Mba Belgium ji ọkpụ goolu itoolu wee supee SanMarino n'asọmpi ha gbara ụnyaahụ iji bụrụ ndị mbụ tozuru oke isonye na egwuregwu Euro 2020. Romelu Lukaku nyere goolu abụọ n'asọmpi ahụ, ebe ndị ọzọ dịka Christian Benteke nakwa Nacer Chadli nyekwara goolu. Ịngland na Check Repọblik ga-ezute n'abali taa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47580194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47580194,New Zealand Video: Ụlọọrụ soshal midia na-agbali ịkwụsị nkesa ihe onyonyo nke Brenton Tarrant kesara,Akụkọ ndị dị mkpa taa:,"New Zealand Shootings :Aka akparala Brenton Tarrant A kpụpụrụ Brenton Tarrant, onye dị afọ 28, ụlọikpe ụbọchị Satode maka mwakpo a wakporo ụlọụka Alakụba abụọ na Nu Ziland A kpụpụla Brenton Tarrant, onye a na-enyo enyo dika isi a hụrụ kwaba okpu na ihe ọdachi ịgbagbu mmadụ iri anọ na itoolu nke mere n'ụlọụka Alakuba abụọ na mba Nu Ziland ụlọikpe. Mba ụwa nọ n'anya mmiri dịka e ji egbe gbagbuo mmadụ iri anọ (49) ma merụọ opekata mpe mmadụ iri abụọ n'ụlọụka Alakụba abụọ dị n'obodo ChristChurch dị na mba Nu Ziland n'ụbọchị Fraide. Otu onye ji egbe so na mkpakpa ahụ nke a na-enyo na ọ bụ Brenton Tarant gosiri onwe ya dịka ọ na-akwa mgbọ n'ime ụlọụka Alakụba. People injured in the shooting have been arriving in ambulances at a hospital in Christchurch Ndị ụlọọrụ soshal midia dịka Facebook,Twitter na Youtube agbaliala ị wepụ ihe onyonyo ahụ mana ndị mmadụ ka na-eke ya n'ebe dịa nille gụnyere na Whatsapp. na agbanyeghị na ndị uweojii dụụ ọdụ ka a kwụsị ikesa ya. Onyeisi mba Nu Ziland bụ Jaccinda Arden katọrọ oke ọdachi mere n'ala ha nke o kwuru na ""ụbọchị jọkarịchara"" nye mba ahụ. Otu onye bu egbe nke kpọrọ onwe ya onye Australia aha ya bụ Brenton Tarrant gosiri onwe ya dịka ọ na-agbasasi egbe n'ụlọụka Alakụba Al Noor Mosque. Mapụ ebe ọdachi ndí omekataraihepụụjọ Ndị uweojii anwuchiela ya bụ nwoke dị ihe dịka afọ iri abụọ nakwa nwoke abụọ ọsọ na otu nwaanyị ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ. Ndị uweojii dọkwara aka na nti ka ndị mmadụ hapụ ebe okpukpere ụka Alakụba na mba ahụ ganye n'udo alọghachi. Otu onye nọ ebe o mere gwara ụlọọrụ akụkọ New Zealand na ya hụrụ nwoke ahụ ka ọ gbara otu nwoke egbe n'obi. ""Anọ m na-eche, na-ekpe ekpere , Chineke mee ka mgbọ gwụ n'egbe nwoke a."" Ọ gba egbe ebe, ọ gba ebe o sị n'ọnụmara ụmụnwoke na-ekpe ekpere gaa fee na nke ụmụnwaanyị. ""Anụrụ m na otu nwaanyị na ndị ọ gbatara anwụọla."" _____________________________________________________________________________________________________________________________________ Ụlọ elu ọzọ adaala n'Ibadan Ụlọ elu ogogo atọ adaala a na-arụ ọhụrụ adaala na Molete dị n'Ibadan nke Oyo Steeti. Dịka ọ dị ugbua a mabeghi mmadụ ole nke a metụtara dịka ndị ọrụ gbatagbata a bịabeghi n'ebe ahụ dịka @TopsyAshaolu siri kwuo n'akara twitter ya; NEMA anabatala ndị Naịjirịa ọzọ esi mba Libya tụbata Ndị Ụlọọrụ gbata gbata bụ NEMA n'ịchafụ a nabatala mmadụ dị otu narị na iri asaa na anọ bụ ụmụafọ Naịjirịa esi mba Libya tụbata. Onye nchịkọta ụlọọrụ a na Legọs bụ Idris Muhammed kwuru na ọnụọgụgụ ndị a ga-eme ya mmadụ puku iri na abụọ, narị ise na iri asaa na anọ atụbatarala. Onye ga-abụ ọkwụ ọtọ ekene eze n'Uefa Champịọns? Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile NLC katọrọ ka ntuliaka 2019 siri gaa Otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ akatọọla Inec maka etu ntuliaka 2019 siri gaa ma kpoo oku ka ha hụ na mmegharị ntuliaka na steeti ụfọdụ nke e hiwere n'abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Maach gara n'anya ya. Ekweghị n'ihe Inec mere-Okorocha Ha na-ebo Okorocha ebubo na ọ chọrọ ka ọgọ ya bụ gọvano Imo steeti Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na Inec enweghị ikike ị nara ya ọkwa dịka onye a họpụtara ga-anọchịte anya mpaghara Ọlụ n' Ụlọomeiwu Ukwu. Okorocha, onye kwuru nke a oge ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja,ụbọchị Wenezde sịrị na ihe na-eme ya sị n'aka ndị na-akpa nkata iji hụ na ọnụ agaghị na-eru ya n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị. Inec wọrọ asambodo mmeri e nyere ndị meriri azọmọkwa sinete ụbọchị Tọzde. Franfurt agbapụla Inter Milan N'egwuregwuEintrachcht Franfurt (entrank frankfot) achụọla Inter Milan ọsọ ụkwụ ete aja n' Europa league dịka ha ji otu ọkpụ gbapụ ha were nweta ọnọdụ n' agba nke abuọ tupu nke ikpeazụ." afirika-52631191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52631191,Madagascar Coronavirus: Gịnị dị n'ime ọgwụ ọhụrụ a azụtara na Madagascar?,"Dịka gọọmentị Naịjirịa nyere iwu ka a tụbata mgbọrọgwụ nke e mepụtara na mba Madagascar iji gwọọ ọrịa coronavirus, ọ bụrụla akụkọ na-ewu ewu ebe niile.","Ụfọdụ mmadụ dịka otu onye Dọkịta bụ McGinger Ibeneme kwuru na ọ ga-adị mma itule ya bụ ọgwụ dịka Minista ahụike bụ Osagie Ehanire si kwuo. O kwuru nke a n'ihi na n'ọnụ ya ""Coronavirus anyụọla mbaụwa niile ịkpakwụ"" ya mere a ga-eji chọọ ọgwụgwọ ọsịsọ. Ngalaba ahụịke bụ World Health Organisation (WHO) na-adọkwa aka na ntị ka e mee ọgwụ ahụ nnyocha mara ma ọ ga-adị mma n'ime ahụ mmadụ tupu e nye ya onye bu ọrịa a. Mana e nwere onye ma ihe dị n'ime ọgwụ a? Kedụ ka o si atọ? Lee ihe anyị ma:" afirika-43578270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43578270,Lee ihe niile ikwesiri ịma maka akpụ ori nwa,Akpụ ori nwa bụ ihe ndị bekee na-akpọ 'uterine fibroid'. Ọ kachasị enye ụmụnwaanyị ndị ojii nsogbu.,O nwere ọtụtụ ihe ndị na akpata ya. Dokịnta Francis Ezenwankwo gwara anyị maka ha. O kwukwara ihe onye nwe ọrịa nwere ike ime iji gbanwe ya. O kwuru na otu akpụ ori nwa si egosipụta onwe ya bụ: Akpụ ori nwa nwekwara ike ịdị n'afọ onye dị ime Dokịnta Ezenwankwo kwuru na onweghi ihe e nwere ike ibido aka na ọ bụ ya kpatara ọrịa a. Mana o kwuru na ihe ndị a nwere ike ibute ya: Ihe onye nwere ya nwere ike ime bụ: Gee ntị nụrụ ihe niile Dọkịnta Ezenwankwo kwuru ugbua. Onye dere akụkọ a: Chioma Nkemdilim Akụkọ ndị ga-amasị gị: egwuregwu-42996084,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-42996084,Nigeria enwetala ọlaedọ abụọ n'ụbọchị mbụ,Nwa afọ Naijiria bụ Ukoro Peter emela ihe ịtunanya site na ịgbatara Nigeria ọlaedọ na mgba nke ndị ndị 55kg mgba Greco-Roman n'ụbọchị mbụ ebidoro mmememe egwuruegwu ahụ na Port Harcourt.,"Ukoro Peter ji ọlaedo kpọọ Nigeria ihu oma n'ụbọchị mbụ nke African Wrestling Championship Nwa amadị ahụ si Bauchi Steeti ji ọkpụ anọ meriri Omar Adel Abdelazi nke Egypt mgbe oge ha zuru. Ukoro siri na ""obi dị m ụto maka mmeri a m meriri"". ""Mgba Greco-Roman na-eme m obi ụtọ. N'ike nke Chukwu aga m abụ ọkachakacha na mgba a."" Lu Shawn Leonico nke South Africa ritera bronze ka o ji ọkpụ anọ merie Linus Katujanda nke Namibia. N'otu aka ahụ, nwa afọ Igbo bụ Ikechukwu Robinson ritere bronze ka o merichara Medhi Dheker nke Tunisia nke o jiri ọkpụ asatọ chara acha were merie na ọgbọ nke 60kg . Onye ritere ọlaedo nke ọgbọ ahụ bụ Ahmed Merikhi nke Algeria onye ji ọkpụ asatọ asatara atọ merie Zeyad Emadeldin Helmi Yakout nke Egypt. Na nke ụmụnwaanyị, Sunmisola Balogun dere aha ya n'ọlaedọ site na itigbu Natasha Nabaina nke Cameroun n'ọgbọ 65kg. O ji ọkpụ ise asatara anọ were nyụọ ya ịkpakwụ ma nwetere Naijiria ọlaedo nke abụọ. Akụkọ a ka na- abia..." 44191715,https://www.bbc.com/igbo/44191715,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ - Fashola,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,"Fashola kwuru na ọrụ kwụsịburu n'akwa Niger nke abụọ oge ọ batara ọrụ, mana ha ga-agba mbọ rụchaa ya Minista na-ahụ maka ọrụ na ọkụ bụ Babatunde Fashola, ekwuola na ebidola ọrụ n'elu akwa Niger nke abụọ, ma kwukwaa na ọ hụghị ihe ga-eme ka a kwụsị ọrụ ebe ahụ ọzọ maka na gọọmentị amapụtala ego e ji arụcha ya. Ebe ọzọ na Naịjirịa Boko Haram na-eji zi ụmụnwaanyị kwara ngwagha ogbunigwe mgbagbuonwe Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua, Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa. Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ. Etu a ka ndị mmadụ gaara esi nwụọ maka ikperechi Ha. Na mba ofesi, Ụgbọelu a kpọkasịrị mgbe ọ dara Achọpụtala na ụlọọrụ Damojh nwe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị ma gbuo mmadụ otu narị na iri na mba Cuba nwetara mkpesa maka ọnọdụ ụgbọelu ha n'oge gara aga. Mkpesa ndị a gụnyere ibufe oke ibu, ingin ịkwụsị ọrụ nakwa nkwụsị igwe na-enye ya ọkụ. N'egwuregwu, Roman Abramovich gotere Chelsea n'afọ 2003 Dịka otu Chelsea buliri iko FA, ị ma na onye nwe ha abịanwughị lelee ka ha si merie? Akụkọ kwuru na Roman Abramovic abatanwughị England maka na o megharịnwughị akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ nke a kpọrọ Visa n'oge. Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa N'ime izu agara aga, ndị otu abuo pụtara n'APC Imo Steeti gara kpesara ndị isi ha n'Abuja ihe na-esere ha. N'ihe onyonyo a, TOE Ekechi bụ otu n'ime ndị na-asị Gọvanọ Okorocha kwapụkwapụ kọwaara BBC ebe ya bụ mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ. Ọgbaghara otu APC Imo steeti eruola Abuja" afirika-44235636,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44235636,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob biko gbaghara - Ọhaneze Ndigbo,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Ohaneze ndị Igbo akpọkuola Ipob Oteela ndị otu Ipob (Indigenous people of Biafra) ji bido ikwu maka 'restructuring' Ndị otu ntorọbịa Ohaneze Ndị Igbo akpọkuola ndị IPOB sị ha gbaghara ma kpee udo. Ha gwara IPOB sị na ndị agbụrụ na mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa ebidola ikwu maka nhazi nke bekee kpọrọ 'restructuring'. Amnesty International ebola ndị agha ebubo Ndị agha Naịjirịa na-agba mbọ ịhụ na ha kwụsịrị mwakpo ndị Boko Haram n'ugwu-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Otu na-ahụ maka mmegide na ikike mmadụ nwere bụ Amnesty International ebola ndị agha Naịjirịa ebubo iwakpo ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ nọ n'ogige ebe ha na-agba ọsọndụ maka Boko Haram. Ha kwuru na ndị agha na-ebu ụzọ kwe ha nkwa ịnyere aka site n'inye ha nri na ihe ndị ọzọ. Mana otu ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na ọ bụghị eziokwu na ihe a na-eme. Okwu ""Nuclear"" Iran E hibere okwu Nuclear nke Iran n'afọ 2015 Onyeisiala ndị mba Germany bụ Angela Merkel ekwuola na China na Germany ga-akwụdo na nkwekọrịta ihe gbasara Nuclear nke ndị Iran, n'agbanyeghị na mba Amerịka pụrụ na mbido ọnwa a. Merkel kwuru nke a ka ya na Li Keqiang bụ onyeisiala ndị China zukọrọ oge ọ gara njem ọrụ ụbọchị abụọ na China. N'egwuregwu Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 Ndị Enyimba ji otu ọkpụ goolu na-asataghị ihe merie Niger Tornadoes ụnyaahụ. Mmeri a mere ka Enyimba rigoo n'ọkwa asatọ na ndị kachasị agba n'asọmpi NPFL ugbua. Gee ya na nkeji nke ututu a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Onye na-akwalite egwu ụka ama ama bụ Anthony Umeh a.k.a Honesty Music ekwuola etu esi o si kwalite ndị ọgụegwu ụka dịka Frank Edwards na ndị ọzọ ama ama na Naijirịa taa. 'Enwere m nti eji ama egwu ga-aga ahia' -Honesty Music" afirika-53274797,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53274797,Lee ihe maamịrị gị na-agwa gị maka ahụike gị,Ịhe ịgbachị maamịrị nwereike ibutere gị.,"Amịrị maọbụ maamịrị bụ mmiri a na-anyụpụta n'ahụ mmadụ na-ebu ihe ụfọdụ ahụ mmadụ achọghịzị. Maamịrị nkịtị nwere mmiri, urea, nnu, nakwa ihe nyere ya agwa ọ tụrụ Bekee kpọrọ ""pigments"". Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ịnọ na maamịrị bụ nke Bekee kpọrọ kolrin, potashium, nnu, sayensi kpọrọ sodium, kritinine (creatinine) ayọn (iron) nakwa ihe ndị ọzọ. Mmiri dị na maamịrị dị pasent iri itoolu na ise (95%). Ihe ndị ọzọ niile a bụzị pasentị ise (5%). Maamịrị nwekwara ihe Bekee kpọrọ 'Urea' nke nwere 'amonia' nke enweghị ike ịmerụ mmadụ ahụ, ya na 'kabọn dayọxaịd"". Mgbe ụfọdụ, ọbara nwekwaraike ịdị n'amịrị bụ nke Bekee kpọrọ ""proteinuria"". Ndị a gosikwara ọrịa imeahụ. Ihe ise eji mara amiri bụ agwa ọ tụrụ (ya bụ ụcha ya), isi, ọrụrọ ya, pH ya (asid maọbụ akalaịn dị ya) nakwa arọ ọ dị mgbe iji mmiri tụnyere ya. Christopher Ọzoanị Ugwu bụ dọkịnta Bekee na-ahụ maka nje n'ụlọọgwụ na Parklane Enugu sị na ịkpachị maamịrị adịghị mma. Ọ sị na ""o nwereike imebetere akịrị (kidney) mmadụ ọgbatauhie"". Ọ sị na ọ dị mkpa na onye ọbụla maamịrị kpawara gara nyụọ ya ozugbo maka ịkpachị ya nwereike imeru onye ahụ ahụ. Gịnị ka ịkpachị maamịrị nwereike ibutere mmadụ? Dọkịnta Chris Ozoani Ugwu sị na ịkpachị amịrị nwereike ibutere mmadụ ahụụfụ na ọrịa mbute. Ndị ọkachamara na Healthline sị na ịkpachị amịrị otu mgbe maọbụ ugboro ole maọbụ ole agaghị eme mmadụ ihe ọbụla ka na ọ nwereike ịme ihe ma ọnye ahụ merezia ya gawa n'ihu. Ha kwuru na ""ịkpachi amịrị ihe dịka awa isii mmadụ na-eme njem nwereike ọgaghị eme ya ihe ozigbo, mana ọbụrụ na onye ahụ kparazịa ya gawa mpiti nwereike ịkwe onye ahụ n'ime ahụ"". Lee ihe ụfọdụ ha sị na ịkpachi maamịrị nwereike ime mmadu: •Onye kpachịrị amịrị ogologo oge nwereike ịbute ọrịa mbute Bekee kpọrọ ""urinary tract infection (UTI)"". •Ọ bụrụ na ị na-akpachị amịrị gị na-enweghị nkwanye ugwu, akpaamịrị gị na akwara ndị ji ya nwereike ịda mba nke bụ na amịrị nwereike ị na-aba onye ahụ kwa mgbe kwa mgbe. •Ọ bụrụ na-ịkpachie amịrị karịa awa iri, akpa amịrị onye ahụ nwekawaraike ịkpọchi nke bụ na ọgaghịzị adị nfe onye ahụ ịnyụ amịrị mgbe ọ chọrọ. •Ịkpachị amịrị nwekwaraike ime ka akpaamịrị mmadụ gbawa, mana nke a na-ahịa ahụ. Ịkpachị maamịrị o nwereike igbu mmadụ? Ndị ọkachamara ọrụ ahụike sị na nke a enweghị ike ime, kama ọbụrụ na onye ahụ kpakarịa amịrị, akpaamịrị ya nwereike ịgbawa. Nke ahụ nwereike ibutere onye ahụ ọnwụ. Kedụ ihe ga-eji mata maamịrị? Eserese maamịrị Agwa (ụcha maamịrị) Ka maamịrị sị adị Mgbe maamịrị gị na-acha mmiri miri ihe o gosiri bụ na ị na-aṅụ oke mmiri karịa ka ị kwesiri. Ụfọdụ ihe na-ewụ bụ ka ndị mmadụ na-aṅụ mmịrị mgbe dum, mana nke a egosila na mmiri nwereike ịkarị n'ahụ mmadụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo. Ha sị na oke mmiri nwereike igbari ""electrolytes"" dị na ahụ mmadụ. ""Electrolytes"" bụ mịnaralụ dịka ""sodium"", ""potashiụm"", ""klorin"" na ""bikanoneti"" bụ ihe na-eme ka akwara nakwa mọzụl mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma ma na-enyekwaaka na ịhụ na asịdi na bezi dị n'ahụ onye ahụ ha. Mana onye amịrị ya na-acha otu a, akụjala maka na mmekwa ya bụ ịwelata aka na mmiri onye ahụ na-anụ. Mgbe ụfọdụ amịrị mmadụ na-acha nwaobere odo odo. Mmụta sị na ọ bụ otu a ka amịrị onye ahụ dị kwesiri ị na-acha. Odo ahụ ga na apụ ma onye ahụ na-aṅụ mmịrị mgbe ọbụla. Ihe na-ebute agwa a n'amịrị bụ mgbe ahụ mmadụ 'hemoglobin' bụ protin na-ebụ ikukundụ Bekee kpọrọ 'oxygen' dị n'ime ọbara. Ụcha maamịrị gị gosiri ka ya bụ protin a si gbaridewe. Mana ịnụkwa mkpụrụ ọgwụ vitamin B na-achakwa amịrị mmadụ odo odo. I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Maamịrị gị nwereike ịcha uhie uhie ma ọ bụrụ na i riri ihe na-acha otu ahụ. E nwere ọtụtụ mkpụrụ osisi na-acha uhie uhie dịka 'blueberries', na ndị otu ya. E nwekwara ọrịa na-eme ka amịrị mmadụ na-acha uhie uhie dịka mgbe 'prostate' onye ahụ zara aza, mgbe onye ahụ nwere akị n'akụrụ Bekee kpọrọ Kidney stone maọbụ mgbe onye ahụ nwere akpụ n'ime akpa akịrị maọbụ akpaamịrị. Ịhụ ụdị ihe ahụ n'amịrị gị were ọsọ were iji ga hụ ndị ọrụ ahụike gị. Mgbe amịrị gị na-acha oroma oroma, o nwereike ịbụ maka ụkọ mmiri n'ahụ gị. Mgbe ụfọdụ ọ na-acha ka nsị agbarịnyere na ya. Nke ahụ nwereike ịbu maka na onunuilu gị bara n'ime ọbara nke gosiri na imeju onye ahụ maọbụ akpa onunuilu ya nwere nsogbu. Onye nwekawara ọrịa imeju Bekee kpọrọ jaundice ga-anyụkwa amịrị na-acha oroma oroma. Amịrị mmadụ ịcha anụnụ anụnụ gosiri na onye ahụ riri ihe na-acha otu ahụ maọbụ na ihe iji eji mee onye ahụ ule na akụrụ ya maọbụ n'akpa amịrị gosiri na amịrị ya. N'ezie a ọ nwekwara nje Bekee kpọrọ pseudomonas aeruginosa na-eme ka amịrị mmadụ chaa anụnụ, mana ọtụtụ mgbe o na-esite n'ihe mmadụ riri. Ọtụtụ mgbe amịrị mmadụ chawa ụrọ ụrọ nke ahụ gosiri na mmiri kọrọ onye ahụ n'ahụ. Mgbe ụfọdụ ọ na-egosikwa onye ṅụrụ ọgwụ dịka Flagyl maọbụ chloroquine. Nrị dị iche iche nwekwara ike igosi n'amịrị mmadụ. Ọ na-egosikwa onye nwere ọrịa imeju maọbụ oninuilu. Maamịrị kochiri ekochi na-egosi onye butere nje. O nwekwaraike ịbụ mgbaama onye nwere ọrịa akụrụ maọbụ na mmiri adịghị onye ahụ n'ahụ. Amịrị ọbụla kochiri ekochi na-agbọ ụfụfụ karịa nwekwaraike igosi na onye ahụ nwere ezigbo ọrịa n'ime ahụ. Mgbe ụfọdụ ndị dọkịnta anaghị achọpụta ihe butere ya ngwa ngwa. Ọ bụrụ na amirị gị atụọ agwa karịa ụbochị abụo maọbụ atọ, gbara gaa hụ dọkịnta gị. Ọzọ Ugwu sịkwa na ụshi amịrị nwekwaraike ịgba ama ọrịa dị mmadụ n'ahụ. Ọ sị na amịrị onye ọrịa shụga ji nwereike ịna esị ụtọụtọ ka ọnye tara mkpụrụosisi na-esi ụshị ọma maka ihe Bekee kpọrọ ketones dị n'amịrị ahụ. Mana ọ sịkwa n'ọgwụ ụfọdụ na-esipụtakwa n'amịrị mmadụ. Ndị ọkachamara ọzọ sị na amịrị anyụrụ ọhụrụ anaghị esị oke isi, mana amịri gbara oge n'esi kpataa. Ha sịkwa na nrị ụfọdụ nwekwaraike isipụta na amịrị mmadụ dịka galik, kọrị, Salmọn, coffee na ndị ọzọ. Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma Cheta na anyi mere maka pH mgbe anyí mere akụkọ maka mmiri akalaịn. Ndị ọkachamara sị na akalaịn dị na amịrị dị mma kwesiri isite 4.6 ruo 8 pH, ebe 6 bụ etiti ya. Ihe kacha ebute mgbenwe n'ime ya bụ ụdị nrị mmadụ riri. Iji maa atụ, nrị nwere protin na-ebutekarị amịri asidi, ebe akwụkwọ nri na-ebutekarị amịrị nwere akalaịn nwereike isi 4.6 ruo 8 pH. Mgbe ụfọdụ, ihu amịrị na adị ka ọnwere anwụrụọkụ n'ime ya. Mgbe ụfọdụ ọ chapụkwa ka mmiri nkiti. Ndị ọkachamara sị na amịrị nkịtị kwesiri ịchapụ nke bụ na e kwesiri ihu ike efere anyụnyere ya anya na-enweghị mgbochi ọbụla. Mgbe ụfọdụ okochitụ ekochi dịka ihe anwụrụọkụ dị na ya. Ọ bụrụ na o kochie nnugwu ka ihe agbarịnyere nzu, mara na ọ nwere ihe dị na ya. Onye ahụ kwesiri ịga nnyocha ịchọpụta ka ọnwere nje maọbụ ogbochi dị n'ụzọ amịrị si apụ. Ekwesighị ịleghere ụdị ihe a anya maka na ọ nwereike ibụ mgbaama ọrịa dịka ọrịa shụga, maọbụ ọrịa ndị ọzọ dị ọjọọ. Ihe ndị a ka nyocha nwereike igosi gị n'amịrị gị dịka nchọputa si gosi. •Ọbụrụ na protin karịa na maamịrị gị ọ na-egosi na ihe na-ayọcha ọbara dị n'ime akụru (kidney) gị Bekee kpọrọ glomeruli gbara ọrụ, ọrịa Bekee kpọrọ proteinuria. •Ọ bụrụ na mmadụ na-anyụ ọbere amịrị nke ihe nwereike ibute ya bụ nkụja maọbụ na akụrụ onye ahụ gbara ọrụ nke nwereike ibute ọrịa Bekee kpọrọ Oliguria. •Ọrịa shuga nwereike ibutere mmadụ ịnyụ oke amịrị nke Bekee kpọrọ Polyurịa. •Nje nwereike ibutere mmadụ oke ụfụ mgbe ọ na-anyụ amịrị. Bekee kpọrọ ọnọdụ a Dysuria. •Ọbụrụ na nje mee ka ọbara dị na amịrị gị, Bekee kpọrọ ọnọdụ a hematuria. •Ọbụrụ na shuga karịa na amịrị gị nke ọrịa shuga bụ diabetes butere, Bekee kpọrọ ọnọdụ a glycosuria. Dọkịnta Chris Ugwu sị na ọ bụrụ na ịnyụọ amịrị n'abalị hụ ahụhụ na ya n'ụtụtụ, mara na shụga karịrị na ahụ onye ahụ. Ọtụtụ ihe anyị na-eri nwekwaraike ịme ka amịrị anyị na anyụ pee nta maọbụ buo oke ibu, otu ahụ ka ọ dịkwa ọbara dị anyị n'ahụ. Mmiri na mmanya anyị na aṅụ nwereike ibute oke amịrị ebe kafin (caffeine) nwereike ịbutu ọbara mmadụ nwekwaike bute ọbara mgbalielu. Mmụta na-akọwa na ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ na-eme ka mmiri ahụ mmadụ na-amịrịr peempe nke na-ebute oke ịnyụ amịrị. World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ' Ọrịa kọlera na-eme njem na Naịjirịa Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị maka maamịrị. Ugboro ole ka ị kwesiri ịnyụ amịrị n'ụbọchị? Ndị ọkachamara sị na onye ahụ dị mma kwesiri ịnyụ amịrị ihe dịka ugboro isii maọbụ asatọ n'ụbọchị. Ọ karịa otu a, o nwereike ịbụ na ihe ndị a na-eme onye ahụ: •Onye ahụ ṅụrụ oke mmiri •Onye ahụ ṅụrụ ihe nwere ""caffeine"" nnukwu. •Onwereike buru na akpa amịrị onye ahụ na-arụ oke ọrụ nke gosiri na onye ahụ buru oke ibu maọbụ na ọna aṅụ ogwụ dị agha. •Onye ahụ nwere nje n'akpa amịrị ya. •Onye ahụ nwere nsogbu na ""prostate"" ya. •Maọbụ na ọkpụkpụ ukwu onye ahụ eriela mperi site na ịmụ nwa. Ọ bụru na ị na-aṅụ mmiri otu o kwesiri ka na anyụ oke ammịrị, gbara gaa hụ dọkịnta gị. Onye gbagolitegoro n'afọ nwekwara ike ịnyụ amịrị karịa otu okwesiri maka na ihe na-akpagbara ụbụrụ ya ama mgbe ekwesiri ịnyụ amịrị Bekee kpọrọ ""antidiuretic"" anaghịzị arụ ọrụ nke ọma. Gịnị mere amịrị ji akpa mmadụ mgbe onye ahụ na-ara otu? Ndị ọkachamara sị na ụdị ihe a anaghị emekawa ụmụnwoke maka na akpa amịrị nwoke na-emechi mgbe uhe (sperm) onye ahụ chọrọ ipụta. Mana ahụ nwaanyị, akpa amịrị ya na otu ya nọketere nke bụ na ahụ ya nwereike ịkpalite amịrị mgbe ọ chọrọ ""ịbia"". Mgbe ụfọdụ amịrị na-abalahụ ha mgbe ha bịawara. Ijide amrịrị onwere ihe ọ na-eme n'ahụ? Ebe dọkịnta Chris Ọzọ Ugwu sị na ịkpachi amịrị nwereike ibutere mmadụ ọgbatauhie, nchọpụta ndị Columbia University mere gosiri na onweghị ihe dị njọ n'ime ya karịa ịba amịrị n'akwa gị. Gịnị mere amịrị ji abakarị ụmụnwaanyị dị ime maọbụ ndị mụrụ nwa? Ịmụ nwa nwereike ịme ahụ nwaanyị ka ọ dọtịa n'ụdị ga na-eme ka ọ na-aba amịrị. Afọime nwekawaraike ịkpado akpa amịrị n'ụdị ga-eme ka amịrị na-apụta mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na nwa dị n'afọ buo oke ibu nke a ga-eme ka nwaanyị dị ime na-aba amịrị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha" afirika-45967482,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967482,2019 Election: Zigara INEC aha Uche Nwosu - Okorocha,Akụkọ ndị dị mkpa taa,"Zigara INEC aha Uche Nwosu - Okorocha Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha agwala onyeisioche Pati APC bụ Adams Oshiomle ka o zigara INEC aha ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-eji aha pati ahụ azọ ọkwa gọvanọ n'afọ 2019. Okorocha kwuru na ọ bụ naanị nke a ga-egosi ugwu Oshiomole nwere dịka onye ama ama n'ime udo. Google echetala dọkịta Stella Adadevoh Ụlọọrụ Google echetela dọkịta Stella Adedevoh bụ onye nwụrụ dịka ọ na agba mbọ igbochi ọrịa Ebola ifesasị n'ala Naịjirịa n'afọ 2014. Taa bụ ncheta ọmụmụ Adadevoh gbara n'afọ iri isii na abụọ. Aka a kparala ndị mmadụ na Kaduna Steeti Gọọmentị Kaduna Steeti ekwuola na aka a kparala mmadụ iri atọ na abụọ aka ha dị n'ọgbaghara na-eme n'ụfọdụ mpaghara steeti ahụ Onye enyemaka ukwu pụrụiche nke gọvanọ ha na mgbasa ozi bụ Samuel Aruwan kwuru na a ga-ekpe ndị a ikpe ma taa ha ahụhụ dị n'ime ya. N'ofesi Otu nwoke bu egbe awakpoola ụlọ nzukọ dị na Pittsburgh, Pennsylvania bụ ebe ọ malitere ịgba ndị mmadụ egbe dịka ha na-efe ofufe. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na nwoke ahụ merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ tupu ọ wụsa ngwa egbe ya ma chilie aka elu. N'egwuregwu N'asọmpi Premier League Liverpool ewerela ọkpụ goolu anọ asatara otu merie ndị Cardiff, ebe Bournemouth gbara Fulham ọkpụ atọ chara acha, Watford ji ọkpụ atọ gbanyụọ ndị Huddersfield, dịka Brighton meriri Wolves n'otu ọkpụ. Ndị Igbo asaala Fashola maka ọchịchị 2023 Nwigwe kwuru na okwu a gosiri na ndị Yoruba chọrọ ị nara ndị Igbo oke ha Ndọrọndorọ gbasara onye ga-enweta oche onyeisala ka na-aga n'ihu dịka minista na-ahụ maka ọkụ Latrik na ụlọ kwuchara na ndị Yoruba ga-eneta oche onyeisiala maọbụrụ na ha tunyere Muhammadu Buhari na ntuliaka 2019. Onyeisi Ohaneze ndị Igbo na Lagos steeti bụ Nnamdi Nwigwe a.k.a Odejimjim ekwuola na ọ bụrụ na enye ndị Igbo ọchịchị onyeisiala n'afọ 2023, Naịjịrịa ga-adịmma ọzọ. Okwuru na okwu Fashola gosiri na ndị na-achị Naịjirịa ugbua chọrọ i me ndị Igbo ohu ruo mgbe ebi ebi makana na ha ma na asị ka ewebe oke, ọ bụ ndị Igbo ka ọchịchị ruru n'afọ 2023. Nwigwe kwuru na ọ bụ maka udiri aghụghọ na-akpasu otu dịka IPOB i gosi iwe ha maka mkpagbu a an-akpagbu ụmụ Igbo na Naịjirịa. N'ọnụ okwu ya, ""anyị agaghị eji okwu Fashola gwu egwu makana o gosiri adịghị n'otu ndị ọchịchị ugbua. Mana ụfọdụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo agwaala ndị yoruba ha chefuo maka ịnweta ọkwa ahụ n'afọ 2023 makana ọ bụ nke ha ebe ụfọdụ ndị Igbo achọghị ọkwa onyeisiala. Ụlọọrụ NNPC etiela mkpu maka mwakpo Ụlọ osisi mmanụ nke Naijiria anaghị arụ ọrụ dịka okwesiri Onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation akpọrọ NNPC bụ Ndu Ughammadu ekwuola na-awakporo ebe esi amipụta mmanụ agbịdị nke si na Port Harcourt ruo n'Enugu ụgboro narị isii kamgbe mbido afọ a. O kwuru na etu o si kwuru ugbua, ha na-edozi, ndị ozu ohi mmamụ agbịdị a na-emebisi ya. N'ofesi, Nwaanyi Khashoggi chọrọ ịlụ ajụla ịhụ Trump Cengiz kwuru na o cheghị na Trump ga-enyocha etu esi gbu Khasoggi Agaghị m aga n'ụlọ ọcha America ga-ahụ Donald Trump. Ọ bụ nwaanyị onye ntaakụkọ Saudi Arabia egburu egbu chọrọ ịnụ kwuru nke a. Hatice Cengiz kwuru na o cheghị na Trump ga-ekwu eziokwu gbasara nyocha a na-eme maka ogbugbu Jamal Khashoggi Cheta na-egburu Khashoggi n'ụlọọrụ Saudi dị na obodo Instabul. Gere Nkeji ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'egwuregwu, Usain Bolt bụ azụ anụ ụka Usain Bolt bụ ọkacha agba ọsọ na mbaụwa Nwoke kacha agba ọsọ na mbaụwa niile bụ Usain Bolt ka kwu chim na-ebum n'obi ya gbasara ị gba bọọlụ. Otu onye so akaja ya bụ onye gbaburu Republic of Ireland bọọlụ bụ Andy Keogh juru ma Bolt ọ ga-agbanwu bọọlụ ma na-akọwa na nke mbụ ọgbara dịka ihe ị kpaọchị. INEC ekwuola na otu ndọrọndọrọ iri asaa n'ime otu iri itoolu na otu ga-ewepụta ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019. Ha kwukwara na ha ga-ewepụta aha niile ndị na-azọ ọkwa onyeisiala taa bụ ụbọchị fraide N'otu aka ahụ Minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Babatunde Raji Fashola agwaala ndị Yoroba ha tụnyere Buhari na 2019 maọbụrụ na ha chọrọ ịrị ọkwa onyeisiala nke 2023 Ọzọ, Ndịisiagha Naịjirịa nke akpọrọ Defence Headquarters Nigeria ekwuola na ha dị njikere maka ọkụ mmụọ Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-eweta. Ha chere aka mgba kwuo na Kanu na-atụmatụ 777 ọhụrụ ha hibere ga-akwata ya. Na mba ofesi Ụmụaka ruru iri n'anọ emerụọla ahụ na mba China mgbe otu nwaanyị bu mma wakporo ha n'ụlọakwụkwọ Kindergaten. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị ahụ ma kwukwa na ha amabeghi ihe mere oji awakpoo ụmụaka ahụ. Onye otiegwu bụ Tiwa Savage agwaala ndị mmadụ na-akọ ya ọnụ na soshal midia maka ihe onyonyo ya na Wizkid mere akpọrọ 'Fever' ha gaa rie stew. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-56312397,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56312397,Nnamdi Kanu bụ onye iro ndị Biafra na-agwa ndị mmadụ ka ha gbuo m - Asari Dokubo,Asari Dokubo bụ ọnye ndọrọndọrọ ọchịchị si obodo Ijaw ekwuola ka Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwụsị izite ndị mmadụ ka ha gbuo ya.,"O kwuru na Nnamdi Kanu bụ onye iro Biafra makana a na-akwụ ya ụgwọ ibuso ọchịchọ Biafra agha. Dokubo kwuru na ọ dịghị mma na Kanu nọ na mba Amerịka na-agwa ndị mmadụ ka ha gbuo ndị Biafra. Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọkaiwu Ipob bụ Alloy Ejimakor ka o kwuo maka ebubo a Asari Dokubo boro Nnamdi Kanu, ihe ọ sara dị n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a. Gere ya n'uju. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52286922,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286922,Covid-19 n'otu nkeji: Mmechi obodo na-enye aka igbochi mfesa coronavirus,"Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari gbatịrị ọnọdụ onye nọrọ n'ụlọ, ndị mmadụ amalitela ịtamu nnukwu ntamu.","Ọtụtụ na-ekwu na ọbụghị atụmatụ dị otu a ga-egbochi mfesa ọrịa coronavirus. Mana ndị dị otu amachaghị ihe na-ekwu. Nnyocha emeela ka o doo anya na ọ bụrụ na ebelata mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, mgbasa ọrịa na-efe efe dịka coronavirus ga-ebelatakwa. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi" afirika-54638439,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54638439,"EndSars Protest: CBN ebola ndị nkwado ngagharịiwe a ebubo 'terrorism', mana lee ihe iwu kwuru...","Akụkọ gbasara etu ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' si kpachie akpa ego mmadụ iri abụọ bụ ndị so kwadoo ngagharịiwe e mere na Naịjirịa nwere n'ụlọakụ n'ọdịnso a, abụghịzị akụkọ ọhụrụ.","Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele Nke na-akpọtụ ugbua bụ na ndị CBN gwara ụlọikpe dị n'Abuja na ihe ha ji kpachie akpa ego ndị a ndị ahụ bụ maka na ego ahụ yiri ego e ji akwado iyi ndụ egwu nke Bekee kpọrọ 'terrorism'. Dịka ụlọntaakụkọ Punch si depụta, CBN gwara ụlọikpe na akpa ego ndị ahụ n'ụlọakụ bụ idebe ihe iwu kwuru. Ha rụtụrụ aka n'iwu a kpọrọ 'Terrorism (Prevention)(Amendment) Act, 2013' Ihe iwu megidere iyi ndụ egwu kwuru O nwere etu ngagharịiwe si yie iyi ndụ egwu? Malachy Ugwumadu, bụ onye ọkaiwu a ma ama, gwara BBC na ihe na-eme n'etiti CBN na ndị nkwado ngagharịiwe 'End SARS' ekwesịghị ekwesị. Ugwumadu jụrụ ajụjụ sị: ""Gịnị kpatara o ji bụrụ ugbua ka CBN chetara na ndị a bụ ndị na-akwado 'terrorism'?"" ""Ọ pụtara na CBN mabu na ndị a bụ ndị na-eyi ndụ egwu, ha wee gbachi nkịtị kemgbe?"" Ọ gara n'ihu kwuo hohaa na o nweghị ihe ọbụla jikọrọ ihazi maọbụ isonye na ngagharịiwe na iyi egwu. 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ' Dịka iwu Naịjirịa si dị, ihe a ga-akpọ 'terrorism' gụnyere: igbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ, iyija gọọmentị, ịwakpọ ụlọ gọọmentị maọbụ ụlọ gọọmentị mba ọzọ dị na Naịjirịa, iji manye gọọmentị ka ha mee ihe dị aghaa mọbụ hapụ ime ihe dị aghaa, nakwa ịkwado ndị mmadụ ka ha mee ihe dị otu a. ""Mana o nweghị ihe dị otu a mere na ngagharịiwe 'End SARS' nke e mere n'ọdịnso a."" Ime ngagharịiwe o megidere iwu Naịjirịaa? Malachy Ugwumadu kwukwara na ""iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike isonye n'otu ọbụla masịrị ya nakwa inwe ọgbakọ etu ọbụla o si masị ya, bụ nke Bekee kpọrọ 'Freedom of Association'"". ""Ndi mmadụ nwekwara ikike ikwupụta obi ha etu o si masị ha, nke a kpọrọ 'Freedom of Expression' na Bekee."" Ugwumadu kọwara na e nwere iwu nke a kpọrọ 'Public Order Act' nke kwuru na ndị uweojii ga-enye ndị mmadụ ikike pụrụ iche tupu ha enwee ọgbakọ ọbụla. Mana n'afọ 2007, Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja kachapụrụ ya bụ iwu, ma kwuo na o sitere n'aka ndị ọcha chịburu Naịjirịa n'oge gboo. Ugwumadu kwuru sị, ""Ka ọ dị taa, o nweghị iwu ọbụla machiri ndị mmadụ ime ngagharịiwe nke udo iji kwupụta obi ha."" Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Onye ntaakụkọ bụ Fisayo Soyombo kwuru na ọ bụ CBN na-eyi ndị mmadụ egwu: Aisha Yesufu kwuru na ọ ga-aka mma ma eziga onyeisi CBN ka ọ gaa Bornos steeti ebe ndị Boko Haram na-enye nsogbu: Faizon Dairo kwuru na onyeisi CBN na-ebutu onwe ya n'ala ịkpọ ndị haziri ngagharịiwe ndị oyiegwu: Ụlọọrụ 'National Broadcasting Commission' tara ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche ahụhụ maka ibu akụkọ gbasara 'End SARS'. 'Ihe niile gbasara okwu EndSARS na CBN nọ n'ụlọikpe'- Ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN Ọtụtụ akụkọ apụtala gbasara etu e si achọ imemina ndị isi ngaghariwe EndSARS na Naịjirịa. Otu n'ime akụkọ a bụ na-akpọchịrị akpaego ụfọdụ ndị so mee ya ngaghariwe ahụ nwere n'ụlọakụ nke Central Bank of Naịjirịa kwuru na ọ bụghị ha mere. Akụkọ ọhụrụ pụtara na ụlọakụ Central Bank of Nigeria gwara ụlọikpe na ego dị na ọba ego ụfọdụ ndị isi ngaghariwe EndSARS bụ nke e chere eji e yi ndụ mmadụ egwu. Ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN bụ Osita Nwanisiobi gwara BBC Igbo na ihe niile gbasara okwu ụlọakụ ha na ndị isi ngaghariwe EndSARS dị n'ụlọikpe nke mere na ọ gaghị ekwunwu ihe ọbụla maka ya. EndSars Protest: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka END SARS na ebe ọ kwụ ugbua Na ndị ntorobịa Naịjiria pụtara ime ngagharịiwe kemgbe ihe karịrị ụbọchị iri na abụọ abụghịzị okwu, ihe onye ọbụla na-ajụ bụ maka ndị a gbagburu na ya bụ ngagharịiwe. Mana dịka a na-ajụ ajụjụ a, ọtụtụ ndị amaghị etu ihe si gagide ije rute etu a. Lee ihe BBC ma maka ngagharịiwe Endsars nke Ọktoba 2020 Gịnị butere ngagharịiwe Endsars? A na-ekwukarị maka Endsars kwa mgbe kwa mgbe n'elu soshal midia ọkachasị mgbe ọbụla ndị uweojii gbufuru mmadụ na mpaghara dị icheiche na Naịjiria. Mana ngagharịiwe Endsars nke Ọktoba 2020 a malitere mgbe ihe onyonyo gosiri ebe ndị uweojii wakporo ma kwatuo otu nwokorọbịa n'ụgbọala ha n'obodo Ughelli dị na Delta steeti. Ndị Naịjirịa bi na Kenya na-eme ngaghariiwe EndSARS Nke a mere ka ndị mmadụ sị na mmegbu ndị uweojii na-eme ndị ntorobia na Naịjiria na ogbugbu a na-egbu ụfọdụ, ezuola, nke mere ha ji kpebie ime ngagharịiwe. Kedụ ebe ọ bidoro? Ngagharịiwe a malitere na Legọs wee garuo Abuja, tupu o si ebe ahụ gawa steeti ndị ọzọ dịka Rivas, Enugwu, Abia, Imo, Akwa Ibom, Ekiti na ndị ọzọ, dịka ndị mmadụ nọchiri ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ na-esikarị agafe. Ọ kwụsịghị ebe ahụ, o sikwa ebe ahụ gafee mba ndị ọzọ gụnyere Briten, Kanada, Amerịka, Jamini nakwa Saut Afrịka, dịka ndị Naịjiria bi na mba ahụ tinyere ọnụ ha. Ndị nọ na soshal midia nọkwa na-eti mkpu nke ha, ka ọha nụrụ olu ha. Gịnị ka ndị na-eme ngagharịiwe a na-achọ? Ha na-akpọ oku ka e kposaa ngalaba uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS), bụ ndị a na-ekwu kacha akpa arụ a megide ndị ntorobia. Ha kwukwara ka e ṅogharịa iwu jigidere ndị uweojii nakwa na-akwụlite ha ụgwọ. Dịka ha na-eme ngagharịiwe ha, ha kwuru na ha agaghị apụ maọbụghị ma gọvanọ steeti ha nakwa onyeisiala Naịjiria apụtara gwa ha okwu banyere ihe ha na-achọ. Gịnị ka gọọmenti mere maka ya? N'ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba, Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari pụtara kwuo na e kposaala ngalaba SARS. Okwu onyeisiala emeghi ka ndị ntorobia kwụsị ime ngagharịiwe ha, dịka ha na-ekwu na ihe ha chọrọ bụ ka e tinye anya n'ihe ha chọrọ ozugbo ozugbo karịa ikwe nkwa dịka ha si emebu. Ndị gọvanọ na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo nwelwara nzukọ ebe ha nọ kpebie ịhọpụta ngalaba ga-elebanye anya na mkpamkpa ndị uweojii na steeti ha dị iche iche. Ndị ntorobia tuziri aka na e kposabuola SARS n'afọ 2017, 2018, 2019 nakwa na mbido 2020 a mana ihe na-ebe ka nọkwa na-ebe. N'ebe dị ka Rivas steeti, Gọvanọ Nyesom Wike tiri iwu iji machie ngagharịiwe na steeti ya, mana ndị steeti ahụ pụtara n'igwe, kwechiri sị na ha ga-emerịrị ya bụ ngagharịiwe n'ihi na ọ bụ ikike ruru ha dịka iwu obodo si kwado. Gịnị mere n'agbanyeghi ihe Onyeisiala kwuru? Ka ụfọdụ na-eme ngagharịiwe na-enyeghi nsogbu maọbụ mebie ihe ọbụla, ka ụfọdụ ndị omekome pụtara na-akpa arụ. N'Edo steeti, ndị omekome si n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ mịpụ. N'Abuja, ndị omekome malitere imebi ihe ndị mmadụ n'ụzọ, na-awakpo ndị na-eme ngagharịiwe. Na Legọs, ụfọdụ ndị omekome malitere iwakpo ndị na-eme ngagharịiwe, ndị uweojii nakwa imebi ụfọdụ ihe. Gịnị mere na Toll-Gate Lekki? Ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki Toll-gate ji obi ọcha ha pụta, dịka ha na-enwe aṅụrị na-agba ma na-egwu egwuregwu ebe ahụ n'ime ụbọchị niile ha nọ na-apụta. N'ụbọchị Fraịde bụ 16 nke ọnwa Ọktoba, ndị alakụba nọ ebe ahụ mee ekpere ha na-enweghi nsogbu ọbụla; n'abalị Fraịde ahụ, a nọkwa ebe ahụ mee ịmụ anya abalị iji cheta ndị nwụrụ n'aka ndị uweojii; otu ihe ahụ mekwara n'ụbọchị ụka bụ 18, mgbe ụfọdụ ndị fada nke ụka Katọlik nọkwa ebe ahụ duo ụka na oriri nsọ. Mana n'ụbọchị 20 bụ Tuzde, ihe niile tụgharịrị dịka ndịagha kwanyere mgbọ ka ndị na-eme ngagharịiwe gbakọrọ. Kedụ etu ihe si ruo etu a? Gọọmentị Legọs steeti tinyere iwu mmachi ngagharị site n'elekere anọ nke mgbede Tuzde, ụfọdụ ndị lawara be ha, mana ụfọdụ jụrụ ịla dịka ha kwuru na ha ga-anọ ruo mgbe gọọmentị gere ha ntị. Ka o ji nkeji ole na ole gafee elekere isii nke abalị ahụ, ndị agha rutere ebe ahụ kwawa mgbọ, ebe ndị mmadụ nọ n'ala jide onwe ha aka ma na-efe ọkọlọtọ Naịjiria. Dịka nke a na-aga ihu, gọọmentị Legọs amagharịkwa ọkwa mmachi ngagharị ha tinyeburu, sị na ha adọtikwuola ya ruo elekere itoolu nke abalị ahụ, ka ndị nọ na kpachi kpachi n'ụzọ nwee ike ịlaru n'ụlọ ha. Gịnị bụ 'curfew'a ụfọdụ steeti tinyere? Curfew ma ọ bụ mmachi ngagharị n'asụsụ Igbo bụ iwu gọọmentị tinyere iji hụ na ndị mmadụ apụtaghị ezi na-agagharị etu o si masị ha. Gọvanọ steeti dị iche iche gụnyere nke Legọs bụ Babajide Sanwo-olu kwuru na ihe mere ha ji etinye mmachi ngagharị bụ iji kwụsị ọgbaghara dapụtara dịka ndị omekome malitere imebi ihe. Ụfọdụ steeti dịka Imo, kwuru na ha na-etinye ya bụ iwu mmachi ngagharị iji gbochie ihe na-eme na steeti ndị ọzọ ime na nke ha. Kedụ steeti ebe curfew a dị? Steeti ndị gụnyere Legọs, Imo, Ekiti, Rivas, Abịa, Enugwu, Ebonyi, Plateau, Edo nakwa Ọshụn abanyela na ya bụ mmachi ngagharị, dịka ha zipuru ndị ọrụ nchekwa ka ha hụ na ndị mmadụ nọ n'ụlọ ha." afirika-43095406,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43095406,Massob: Gaanụ tinye aha unu n'akwụkwọ ntuliaka,"N'akwụkwọ ozi nke Ugwuoke Ibem Ugwuoke, onye odeakwụkwọ nke otu Massob binyere aka, ha kwuru ka ndị otu ha niile nọ n'ala Naịjirịa gbaa mbọ ga-tinye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ma nweta Permanent Voters Card n'ebe ndị INEC wepụtara maka ndebanye aha ka a ghara inwe mgaramara.","Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị: ""Akwụkwọ ntụliaka Naịjirịa abụghị sọọsọ maka mbinyeakanakwụkwọ nke Naijiria, mana ọ ga-abụ ihe a ga-eji tinye aka ime ntuliaka referendụm maka nwereonwe Biafra."" Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na erubeghị isi na idebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka bụ mmadụ iji aka ya merụọ onwe ya ahụ nke nwere ike imebi mbọ inweta mnwereonwe Biafra. ""Maka inweta Biafra nke United Nations ga-akwado, ọ bụ ndị tinyere aha ha maka ntuliaka na Naijiria."" Ihe mmụta si na census gara aga Na nkọwa ya, onye mgbasa ozi Massob bụ Comrade Edeson Samuel gwara onye ntaakụkọ BBC sị: ""Anyị matara na voters card dị mkpa nye onye ọbula bụ Biafra n'ihi na ọ bụ sọ onye nwere ya ga esonye ime referadum maka Biafra. Comrade Samuel dọrọ ndị Igbo aka na nti ka ha gba mbọ hụ n'ụkwụ ha zọhiere oge gara aga, mgbe ha juru itinye aha ha maka ịnata akwụkwọ ntuliaka na isonye na ọnụọgụgụ nke a kpọrọ census na bekee, ọzọ. Ọ sịrị na agwa ahụ mechara ghọọ mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya. ""Ihe ndị a mere ka ndị Igbo pekarịa n'ọnụọgụgụ, ebe anyị ma na ọnụọgụgụ ndị Igbo karịrị."" Cheta na ụnyaahụ na INEC kwuru na ndị si n'ọwụwa anyanwụ so na ndị pekarịchara mpe na ndị tinyegoro aha ha n'akwụkwọ ha." afirika-45255941,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45255941,Mwakpo a na-eme n'ugwu Naịjirịa na-amapụ anyị obi - Gọọmentị,Minista na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Mansur Dan-Alli kwuru na mwakpo ndị oyi ndụ egwu na nsogbu ndị ọzọ dị n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa na-amapụ ndị ọrụ nchekwa na gọọmentị Naịjirịa obi nke ukwuu.,"Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Dan-Alli kwuru nke dịka ya na ndi ọzọ ọkwa ha gbagotere n'ihe banyere ọrụ nchekwa na onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ ụnyaahụ n'obi Buhari dị n'Abuja. O kwuru na ọgbakọ a bụ ụdi ha na-enwe kwamgbe iji mee ka onyeisiala mara nke na-eme n'obodo. Cheta na mwakpo ndị oyi ndụ egwu Boko Haram mere na Borno na Yobe steet tara isi ọtụtụ ndịagha Naịjirịa na nso nso a. Nke a mere ka onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai jiri wepụ onye na-ahazi agha Boko Haram n'ọnwa gara aga. Dan-Alli kwuru na onwere ihe ha kpebiri maka nsogbu a, mana okwughi ihe ọ bụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53517123,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53517123,Ababanna: Ihe ndị uweojii kwuru maka ebubo imetọ nwa dị afọ 12 a na-ebo otiegwu a,"Otiegwu a ma ama n'ala Igbo bụ Uba Obinna Agbaso, aha otutu ya bụ 'Ababanna' nọ n'aka ndị uweojii Agbala dị n'Okpuruọchịchị Owerri-Nọt azara ọnụ ya ugbua kemgbe abalị atọ maka ebubo ịwakpo nwatakịrị gbara afọ iri na abụọ.","Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikokwu gwara BBC Igbo na ha ka na-enyocha ya bụ nwaamadị ka ọ dị ugbua. O kwukwara na ya bụ okwu agbaala oge tupu ndị mụ ya bụ nwa ewetara ya ndị uweojii. Orlando sị na ya bụ ihe mere ọnwa abụọ na ọkara gara aga, ebe nna nwatakịrị ahụ bụ Victor Okereocha buteera ha ya bụ ikpe abaalị atọ gara aga. Akwụkwọ akụkọ 'The Nation' kọwara na ya bụ nwaamadị kwasara nwa ahụ iko n'ike ugboro atọ mkpe nna ya anọghị ya. Akụkọ anyị nụrụ bụ na ha bi n'otu ebe n'Owere ebe ahụ. Orlando na-adọ aka na ntị ka onye ọbụla ụdị ihe a mere were ọsọ bịa gwa ndị uweojii ka ọ nwere dị nfe igosi na ya bụ ihe mere n'ezie. O kwuru na ọ bụ eziogkwu na-aga ejere ya ụlọọgwụ maka nnyocha, mana o nwere ike ịhịatụ nwaahụ ịhụ mmgbama n'ahụ nwa ahụ maka ọ teela aka ya bụ ihe mere. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-56895495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56895495,Ọgba mbọ: 'Ụmụ nwoke anabughi ekwe ka m metụ ha aka n'isi',Ada Chukwujekwu kpọrọ onwe ya ọkibe n'ịkpụ isi.,"O kwuru ka o si bido kpụwa ndị mmadụ isi nakwa ihe kpalitere mmụọ ya ịkpu ịsị. Dịka o si kwuo, ma gwa ụmụ nwaanyị ibe ya ""uru dị na ọrụ"" Lee okwu ya n'uju ebe a:" 43946041,https://www.bbc.com/igbo/43946041,Ị ma na Buhari yiri Trump? Lee ụzọ anọ gosiri ya,"Dịka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari mere njem ọrụ gaa mba Amerịka ka ya na onyeisiala ha bụ Donald Trump nwee mkparitaụka ọganiru obodo abụọ ahụ, ị lee anya na ndụ mmadụ abụọ ndị a, ị ga-ahụ na ha yiri onwe ha n'ụzọ dị iche iche.","Buhari na Trump anaghị ata okwu eze Lee anya n'ụfọdụ n'ime ha: 1. Ha abụọ banyere ọchịchị na nka Ọ bụghị akụkọ na Buhari na Trump bụ agadị abụọ na-achị mba ha, n' oge a ndị mba ụwa na-ekwu maka ndị ntọrọọbia iweghara ọchịchị obodo ha. Ha abụọ banyere ọchịchị ka ha gbachara afọ iri asaa (70). Buharị dị afọ iri asaa na atọ (73) n'afọ 2015 oge ọ banyere n'ọkwa ọchịchị, ebe Trump dị afọ iri asaa na otu (71) n'afọ 2017 oge ọ banyere. 2. Etu ha siri banye ọchichị yiri onwe ha Ha abụọ banyere n'ọkwa ọchịchị ka ha merichara na ntuliaka kachasị tụọ ọha mmadụ n'anya. Mmeri Trump meriri Hillary Clinton onye ọtụtụ ndị mmadụ chere kara ịbụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisiala Amerịka, tụrụ ndị mmadụ n'anya dịka nke Buhari meriri Goodluck Jonathan onye bụ onyeisiala oge ahụ siri gbagwojuo ọtụtụ mmadụ anya. Mgbasaozi e mere tupu ntuliaka kpọbatara ha, kpalitere ọkụ ịkpa oke agbụrụ n'ụdị ahụbeghị na nsonso na mba abụọ a, nke ka na-aga n'ihu ugbua. 3. Ha abụọ anaghị ele ndị ntaakụkọ ala ha anya ọma Ọ bụghị ihe zoro ezo na Trump ejighị anya ahụ ndị ọrụ ntaakụkọ. Ọtụtụ na-ekwu na Buhari n'onwe ya dịkwa etu ahụ. Okweghị ndị ntaakụkọ Naijiria aghọta ihe bụ na ewepụ mkparịtaụka, Buharị na-ekwuputakarị okwu dị mkpa gbasara atụmatụ ya oge ọbụla ọ gara mba ofesi. Kemgbe ọ banyere n'okwa ọchịchị, naanị mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ mere na Disemba 30, 2015, nke Channels TV chịkọtara, bụ okwu Buhari gwara ndị ọ na-achị n'ụlọ, ndị ọzọ bụ n'ama. Trump n'onwe ya bụ onye ama dịka 'onye iro' ndị ụlọakụkọ ndị Amerịka. Ọtụtụ oge, ọ bụrụ na ọ naghị akpọrị CNN na Twitter ya, ọ bụrụ otu onye ntaakụkọ ka ọ na-akatọ. A na-ebokwa ndị ntakụkọ ebubo na ha kpọrọ onyeisiala abụọ ahụ asị. 4. Ha abụọ ji okwu akusu ndị ha na-achị. Trump na Buharị anaghị ata okwu eze tupu ha kwuo ya, nke mere ndị ha na-achị ji akpọrị ha maka ya. Ihe ọbụla gbatara Trump n'obi ọ na-ekwupu ya n'igwe okwu Twitter. Ọtụtụ ndị Amerịka echefubeghị okwu Trump dịka; #Covfefe, 'Afrịka bụ obodo ike nsị' (#shitholecountries) wdg. Buhari anaghịkwa ahazi okwu, n'agbanyeghị ebe maọbụ onye ọbụla nọ ebe ọ na-ekwu okwu. Oge ọ gara Germany, Buhari gwara Angela Merkel na nwunye ya enweghị ọnụ n'okwu otu pati ya bụ APC, na ọ bụ sọsọ 'n'ọnụ ụlọ nke ọzọ' ka o nwere ọnụ okwu. Na nsonsọ a, ọ gwara ọgbakọ ndịisiala Commonwealth na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ na-achọ nleta ahụike, ụlọ na ihe ndị ọzọ na-akwụghị ụgwọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44309619,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44309619,Ejidela ndị otu Biafra Zionist Federation wakporo ụlọọrụ Gọvanọ Enugwu,"Anwuchiri mmadụ iri abụọ bụ ndị sị na ha bu ndị so n'otu chọrọ Biafra nakwa onyeisi ha a na-akpọ ọkaiwu Benjamin onwuka n'Enugwu ụnyaahụ ka ha gara ị wakpo isi ụlọ gọọmentị n'Enugwu, ndị uweojii kwuru.","Otu ndị na-achọ Biafra dị ọtụtụ Ndị uweojii kwuru na anwụchiri ndị a mgbe ha gara iji aka ike banye na ogige ụlọ gọọmentị Enugwu. Onye mgbasa ozi ndị uweojii n'Enugwu bụ DSP Ebere Amaraizu kwuputara na ndị ahụ ejidere bụ ndị kpọrọ onwe ha 'Biafra Zionists Federation'. Amaraizu kwuru na ndị ahụ malitere ngagharị iwe site na Bisala road dị n'Enugwu were gaa na obi gọvanọ Enugwu ebe ndị uweojii na ndị otu nchekwa ndị ọzọ nwụdezịrị ha. Ya bụ nwa amadị mere onwe onye isi ndị zionists ahụ bụ Benjamin onwụka bụ onye ka na azara ọnụ ya n'ụlọ ikpe maka ebubo mile eboro ya oge gara aga, Ha gunyere, ịgbụ mmadụ, izu ohi nakwa ibu egbe na ejighị ịkịkere ị bu ya. Amaraizu sịrị na ndị ahụ nozị na-aka ndị uweojii ebe nyocha na-aga n'ihu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52675213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52675213,Coronavirus domestic violence: Ịzọpụta onwe gị n'aka onye na-emegbu gị n'ime 'lockdown' a,"Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma mbaụwa bụ United Nations ekwuola na mmegbu ụmụnwaanyị oge mmechi obodo bụ ihe a kpọrọ ""shadow pandemic"" n'asụsụ Bekee.","Eserese na-egosi ebe nwoke na-abara nwaanyị na-agụ akwụkwọ mba, ọ gbachi ya nkịtị Na mpaghara Afrịka, ndị ọchịchị, ndị uweojii na ndị na-ahụ maka ikike dịrị onye ekwuola na mmegbu ụfọdụ ụmụnwoke na-emegbu nwunye ha na enyi ha nwaanyị bịara na-arị elu dịka a banyere na mmechi obodo a. Mana gịnị ka ị nwereike ime onwe gị n'ụdịrị ọnọdụ a? Anyị jụrụ ndị ọkachamara nakwa otu nwaanyị si na mmegbu zọrọ isi onwe ya, ebumnuche ha na ndụmọdụ ha. ""Ị nọrọ n'ime mmegbu, ị ga-ahụ na e nwere usoro ihe si aga, Esther (ọ bụghị ezigbo aha ya) gwara m, dịka ọ na-echeta afọ atọ ya na onye ọ lụburu na-eti ya mmọnwụ oge ọbụla - ma iti ya ihe nakwa ịkpọgbu ya n'iyi. ""Na ngwụcha izuụka ka ọ na-ejikarị aka njọ, makana mgbe ahụ onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ. Mgbe ahụ ka onye ọ bụ gị na ya ga-enwe ọtụtụ oge ọkachasị ma ọ bụrụ na ike ịnọ n'ụlọ agwụla ya. Nke bụ na ị ga-ahụ na ha chọrọ ịchọ okwu. Ha ga-akpara gị nkata - ihe dịka ikwu okwu ga-akpalite gị ka ị nwee ike saa ya ma tizie gị ihe mgbe ị sara. ""Ọ bụrụ na ụbọchị abụọ nwereike ime ka onye ike ịnọ n'ụlọ gwụrụ chọọ iti gị ihe, chezie uche ihe otu ọnwa na ụma a sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ apụtala ezi buterela ndị mmadụ. Nke ugbua abụghịzị naanị ike ọgwụgwụ ịnọ n'ụlọ, ọ bụ ma mgbakasị ahụ ma ụjọ."" Eserese na-egosi nwaanyị nọ n'elu oche n'ime ebe a gbachiri ya Ọtụtụ afọ agafeela ugbua kemgbe Esther kwarala ibu ya hapụ di ya. Mana mgbe ahụ, ọ kadị mfe isi na mmegbu ahụ gbalaga karịa etu ọ ga-adụ ugbua, ọ ga-ewe oge na obisike. ""Ọ dị m ka m nọ na mkpọrọ ebe m agaghị esinwu pụọ makana ihe rara ahụ, ma akụnụba o, ma ọnọdụ echiche obi, ma n'ọnọdụ echiche ụbụrụ - ma gụnyekwa ụmụ m. Ọzọkwa, nne gị ga na-enwe aṅụrị na ị lụọla di, nke bụ na ị ga na-eche - ekwela ka aṅụrị ya kwụsị. Nọrọ."" Maka ụmụnwaanyị chọrọ ịhapụ di ha na enyi ha nwoke n'oge mmechi obodo a, ọ ga-ara ha ahụ karịa. Ha chọọ ịpụ, ndị uweojii nwereike ịgwa ha na ha dara iwu onye apụtala ezi, ọzọ bụkwa na o nwereike ịra ha ahụ ịhụ ụgbọala ga-ebu ha. Ọtụtụ mba ewepụtala akara ekwentị mgbata ọsọ enyemaka, maka inye ndị na-agabiga mmegbu ndụmọdụ nakwa inyere ha aka. Ndị na-achọkwanụ ha maka enyemaka a dị ọtụtụ. 'Ndị a na-emegbu emegbu na-arị elu' N'isi mbido oge a machiri ịpụta ezi na mba Saụt Afrịka, ndị uweojii natara mkpesa 2,320 gbasara mmegbu ụmụnwaanyị - nke ji pasentịụ 37 karịa ka ha na-enwetabu mbụ. Na mba Zimbabwe, otu ụlọọrụ ekwentị mgbata ọsọ enyemaka ahụ kwuru na ọnụọgụgụ mkpesa ha nwetara ji okpukpu atọ karịa, ebe Dorothy Njemanze bụ onye bu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi, gwara BBC News na etu ọnụọgụgụ ndị a na-emegbu emegbu na Naịjirịa si arị na-eche ya uche: ""Ụjọ na-atụ anyị na ọ dịrị etu a na-aga, ndị mmadụ nwereike ịnwụ tupu e mepee obodo ọzọ."" Ụfọdụ mba dị n'Afrịka ewepụtala ụzọ a hụrụ anya e ji enyere ụmụnwaanyị aka. Na Tunishia, ebe mkpesa maka mmegbu n'ime ụlọ jirila okpukpu ise karịa etu ọ dịbu, gọọmentị ewepụtala akara ekwentị gbatagbata ma wepụta ebe mgbaba asatọ maka ndị a na-emegbu nakwa ụmụ ha, na-ekwukwa sị chebiri ụlọ mgbaba ndị ọzọ. Eserese na-egosi ka nwaanyị nọ n'ime 'mkpọrọ' na-akpọ onye na-ahụ maka ikike dịrị onye N'ụfọdụ ebe ndị ọzọ, e mepere ọtụtụ ebe mgbaba ma nwekwaa ndị wepụtara onwe ha inyere ụmụnwaanyị aka igbafu. Na Zimbabwe, ndị okenye 21 na ụmụaka asaa ji ụlọọrụ Roots One Stop Shelter mere ụlọ mgbaba. Beatrice Savadye bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ kwuru na ha na-agba mbọ ịkpọpụta ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọ ebe a na-emegbu ha. Ndị uweojii na-akpọnyekwa ha ụfọdụ. 'Ebe mgbaba ụmụnwaanyị' Na Kenya, Dianah Kamande bụ onye ọrụ ya bụ inyere ndị mmadụ aka, kwuru na ndị nwere ụlọ mgbaba ka na-anabata ụmụnwaanyị, ma kwuo na ụlọọrụ ya anabatala ụmụnwaanyị 17 naanị na Naịrobi. Na Naịjirịa, n'agbanyeghi na ọtụtụ ebe mgbaba ụmụnwaanyị mechiri n'ihi mmechi obodo e tinyere, ndị na-enye aka n'efu ka na-enyere ụmụnwaanyị aka ịgbapụta ma lakwuru ezinaụlọ ha, dịka Titilayo Vivour, bụ onye na-achịkọta ngalaba na-ahụ maka mmegide mmadụ na Legọs steeti bụ Domestic and Sexual Violence Response Team, si kwuo. Mana maka ebe mgbaba nke Ghana bụ Ark Shelter, Nana Sunnu bụ onye na-achịkọta ya kwuru sị na ha enweghi ikike ịnabata ndị ọhụrụ n'ihi ụjọ mbufe ọrịa coronavirus nakwa enweghi ebe a ga-edopu ndị mmadụ iche. Esther bụ onye si na mmegbu gbapụta ma soro ndị ọzọ gbapụta na-arụ ọrụ ugbua, kwuru sị ka ụmụnwaanyị na-akpọ akara ekwentị ndị e wepụtara ma ọ bụrụgodi na ha nọ na mba ndị ụlọ mgbaba ha mechiri emechi. ""Gbalịa kpọkuo ndị na-ebu ikike dịrị onye n'isi site na soshal midia, ndị nke ị nwere ịtụkwasị obi. Kpọo ha, ha nwereike inyere gị aka tụmadị n'ime mmechi a."" Eserese na-egosi ebe ndị mmadụ na-esetị aka ha na-enye nwaanyị tọrọ na 'mkpọrọ' Nthabiseng Ramothwala bụ onye na-ahụ maka ọnọdụ ahụike ụbụrụ mmadụ na Saụt Afrịka kwuru sị na ọ dị mma ka ndị mmadụ na-enyere ndị agbataobi ha nwereike ịnọ na mmegbu. Ọ dụkwara ụmụnwaanyị ọdụ ịrịọ ndị gbara ha gburugburu enyemaka. ""Mara ndị uweojii nakwa akara ekwentị ndị ị nwereike ịkpọ,"" ka ọ gwara BBC. ""Mee ka ndị agbataobi gị marakwa, gwa ha ihe nhụwa ama ha ga na-elepụ anya iji mara mgbe ha ga-eji gbatara gị ọsọ enyemaka. Nye ha akara ekwentị ezinaụlọ gị ndị nwereike ịbịa zọpụta gị."" 'Anyị na-agba mbọ ịzọ onwe anyị ndụ' Maka ndị enweghi ụzọ ha ga-esi gbapụta, Esther nyere ha ndụmọdụ. ""Ị kwesịghị imechi ọnụ n'ihi na ị chọrọ ka onye ọzọ nọrọ mma, mana n'ọnọdụ a, ọ bụrụ na ha kwuo ihe fụrụ gị ụfụ, gbachị ha nkịtị. Ha kpasuo gị iwe gaa gụọ akwụkwọ maọbụ mee ihe ọzọ iji wepụ obi gị ebe ha nọ. ""Ọ bụrụ na ị ga-editenwu otu ọnwa na abụọ maọbụ atọ na-abịanụ... mee ihe ọbụla ị ga-emenwu ga-enyere gị aka idi ya. Amaghị m ma anyị a ga-akpọnwu atụmatụ ndị a ngwọta. Ha bụ naanị ihe nwa mgbe nta. ""Ugbua, naanị ịzọ ndụ ka anyị na-agba mbọ ya, ya bụ na ị ga-ekwu ihe ha chọrọ ịnụ, mee ihe ha chọrọ ka ị mee, ka ị wee dịrị onwe gị ndụ.""" mba-uba-43024560,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43024560,Ụgbọelu dara n'ụzọ Russia egbuola ọtụtụ mmadụ,Ozị na-eru BBC nti ugbua na-ekwu na ụgbọelụ ndị Russia e jị ebu ndị njem adaruola ala ihe dị ka kilomita iri asatọ ọ hapụchara Moscow.,"Udiri ụgbọelu dara Ụgbọelu a bụ nke ndị Saratov anụ bụ An - 148 safuru n'ikuku ka ọ nọ n'ụzọ obodo a na-akpọ Orsk. Content is not available End of Twitter post, 1 Akọkụ ndị Interfax kwụrụ n'ụgbọelụ a kuririakuri n'obodo Argunovo nke bụ na onweghị onye a na-atuanya ịpụta na ya. Mmadụ isii ndị na-elekọta ya bụ ụgbọelụ anya so n'ime ya. Anyi ka ga ewetara ụnụ ozi maka ihe ma anyi nweta ya." afirika-45167341,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45167341,Rochas enyeela ndị Imo ezumike ọrụ maka PVC,Imo steetị enweela ụbọchị ezumike abụọ!,"Gọvọnọ Imo steeti bụ Rochas Okorcha kwuru na ụbọchị Wesdee bụ Ọgọóst 15 na Tọọsde bụ Ọgọọst 16 ga-abụ ụbochị ezumike na steeti ha. Nke a bụ maka ị nye onye ọbụla ohere i jee nata akwụkwọ ntulaka ha nke Bekee kpọrọ PVC. Ndị agha Naịjirịa nọ n'ugwu na-ewe ezigbo iwe ugbua Ha mere nghagharị iwe makana ha nụrụ puke puke na ndị na-achị ha chọrọ izipu ha gawa ebe ọ na-ekpo ọkụ n'agha Naịjirịa na Boko Haram. Ndị agha a jiri iwe na-agba egbe na odo ugboelu ma jụọ cha cha na a ghaghị aba ụgbọ elu ha. Mmadụ 39 anwụọla na Idlib n'ime mba Syria Na mba ofesi, akwa ohụrụ na-ebe n'obodo Idlib n'ime Syria dịka ogbunigwe si gbariri otu ụlọ nakwa gbuo mmadụ iri atọ na itoolu. Mmadụ iri na abụọ n'ime ha bụ ụmụaka. Amabeghí ihe kpatara ogbunigwe jiri gba, mana agha ka na-ada na Syria. Ihe niile mere na Premier League N'egwuregwu, Manchester City emeriela Arsenal ọkpụ abụọ na-asaghi ihe n'asọmpị Premeir League ha gbara unyahụ. Liverpool meri kwa West Ham ọkpụ anọ asatara ihe. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị" 42725988,https://www.bbc.com/igbo/42725988,Kelechi Iheanacho emeela ihe eji kpụrụ ya n'ọnụ,Kelechi Ịheanachọ nyere goolu ka Leicester City na Fleetwood gbaa asompị nke atọ FA mere ka ọ bụrụ onye mbụ eji Video Assistant Referee kwudo goolu ya.,Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ ka ha (ndị Leicester City) na Fleetwood sọrọmpi maka iko FA Ịheanachọ bụ onye nke mbu onye inyemaka nke na-ahụ maka ihe onyonyo ogbu bọọlụ nyere efe ị nye goolu. Iheanacho nyere goolu nke a mgbe Islam Slimani gbara onye nke a bọọlụ. Okwu tebinitere na ya bụ asọmpị mgbe onye ogbu bọọlụ kagburu otu goolu maka mmehe akpọrọ offside. Nke a bụ ugboro atọ a na-anwa ọrụ aka onye inyemaka nke na-ahụ maka ihe onyonyo ogbu bọọlụ na asọmpị bọọlụ n'ime onwa nke a. afirika-49863024,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49863024,Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo,"Na mgbe gboo, ichi nze so n'emume e ji ama onye tozuru ihe e ji nwoke eme.",Ọ na-abu ndi kajara akaja ma bụrụkwa ndị eziokwu ka a na-echi nze maka na ihe dị na ya buru ibu ma takwaa akpụ. Nke a pụtara na iwu so na ya ga-ara ahụ nke na onye akaghi aka agaghị emenwu ihe dị na ya. Akụkọ a Chris Okereke mere na-egosi usoro na ihe ụfọdụ dị na ya bu njem ị bụ nze n'ala Igbo. Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke Akụkọ ga-amasị gị 51166312,https://www.bbc.com/igbo/51166312,Biafra at 50: 'Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ',Ọ kwa ị na-anụ maka Patrick Kaduna Nzeogwu?,Bute oche ka i gere ihe nwanne ya nwaanyị bụ Theresa Nzeogwu gwara anyị maka etu o si sonye Ndịagha nakwa ihe o mere mgbe ọ kwaturu ọchịchị Naịjirịa. Ihe ndị ọzọ o kwukwara ga-atụ gị n'anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-54327127,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54327127,Liverpool akwọọla Arsenal ka awarawa tomanto,Liverpool egosila Arsenal mbe abụọ nke bụ oke oge ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ha n'abalị Mọnde.,"Cheta na Arsenal bu ụzọ merie Liverpool oge ha abụọ zutere n'asọmpi Community Shield na mmalite afọ ọhụrụ 2020/2021 Mana Liverpool kọwaara ha na anụ gbalaa taa echi bụ nta. Arsenal bu ụzọ nyete goolu oge Lacazette nyere gollu na nkeji nke mbụ. Mana oteghi aka tupu Sadio Mane asaa goolu ahụ, Richrdson etinye ya mmezi. Na agba nke abụọ ka Liverpool nyetere goolu nke atọ iji gbagoro n'elu Tebulu EPL." afirika-57138133,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57138133,"AFRICA EYE: Maka onye bụ ""Ordinary President"" nke 'Brekete Family' na Naịjiria","Ahmed Isah, onye a ma dịka 'Ordinary President', bụ onye bu ihe gbasara ikike ruru onye n'isi, ma bụrụkwa onye na-enye ndị mmadụ ụdịrị ikpemkwụmọtọ na-amasị ha n'ejije a na-akpọ 'Brekete Family' nke a na-eme n'ihe onyonyo nakwa na redio.","Ihe gbasara Isah na-amasị ọtụtụ ndị Naịjiria na-ahụta ya dịka onye na-enye ndị a na-emegide na ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Isah na-atụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị uweojii mmehie ha n'ihu ma ọ nọrọ n'igwe okwu, mana nke ahụ emeghi ka ha kpọọ ya asị. BBC Africa Eye sogharịrị Isah na ndị otu ya n'izu ole na ole gara aga, ma chọpụta na ọ bụghị usoro ya niile dabara adaba n'agbanyeghi mmadụ ole o nyerela aka. Ihe nọ n'akụkọ a nwereike irikasị gị ahụ: Onye haziri akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo" 46963323,https://www.bbc.com/igbo/46963323,Muhammadu Buhari: Iwe Obasanjo bụ na Buhari gbochiri ebe e si ebupụsị ego,"Joe Igbokwe,ọnụ na-ekwuru otu APC na Legos steeti asaala Olusegun Obasanjo okwu o kwuru maka Muhammadu Buhari.","Igbo kwuru na ọ bụ iwe na Buhari gbochiri ebe e si ebupụsị ego ji Obasanjo. Na mkparịtaụka BBC na Obasanjo nwere na nsonso, o kwuru na Buhari amaghị ọrụ ma ncha, na ọ na-akpa oke nakwa na o nweghị ahụ ike nke elu ahụ nakwa nke uche. Mana Joe Igbokwe kwuru na okwu ahụ bụ 'okwu nkọgheri' n'ihi na "" ihe Obasanjo arụnwughị n'afọ asatọ ọ nọrọ na ọchịchị na Buhari, onye o kwuru na ahụ adịghị rụrụ ya n' afọ abụọ." afirika-50114925,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114925,Bobrisky: Ọ lụrụ ọgụ ka nwoke ka-e suru ụgbọala ya?,Onye a ma ama maka iyi efe ma na-etecha ntecha ụmụnwaanyị bụ Bobrisky egosila ihe o ji bụrụ dimkpa site n'ịlụsa nwoke suru ụgbọala ya ọgụ.,"Bobrisky, onye ezigbo aha ya bụ Idris Olarenwaju, depụtara n'akara Twitter ya na ya gakwaara onwe ya ọgbakọ mgbe nwoke ahụ ji ụgbọala ya suo nke ya. Mana Idris kwuru na okwu bidoro mgbe nwoke ahụ bidoro mawa ya aka n'ihu jụwa ihe ọ pụrụ ime ya. O kwuru na o mesiri nwoke ahụ ike ma gosi ya na ọ bụghị ya ka a na-amara aka. Gụọ ihe o dere n'uju ebe a. End of Instagram post, 1 Nwoke ahụ agbarala ọsọ rịọ Bobrisky mgbahara. Ụmụ mmadụ na-ekwu ọtụtụ ihe maka ihe mere na soshal midia. @Blessyn_coco kwuru na isi ndo ezughi. @Haryordeylaymi kwuru na ihe a gbagọjuru ya anya. Bobrisky bụbu nwoke mana ọ na-ekwusi ike na ya bụzi nwanyị ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị Onitsha fire: ""Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?" afirika-50635540,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50635540,Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya?,Ezenwaanyị Obi Martha Onyemachi Dunkwu bụ onye nọ n'ọkwa pụrụiche n'Ọkpanam malitere afọ narị asaa gara aga bụ nke na-elekọta ụmụnwaanyị ma bụrụkwa onye ji ọfọ agbara ha.,"Onye nọ na-ọkwa dị otu a ka ha na-akpọ Ọmụ. Ihe iwu kwuru bụ na nwaanyị ọbụla nọ n'ọkwa ""Omu"" agaghị alụ dị. Ọ lụgodi dị, ọ ga-esi be di ya pụta nọrọ onwe ya. Echicha ya echiche Omu, a ga na-ewezi onye ahụ ka nwoke nke bụ na ọ nwere ịwa ọji ma lụkwaa nwaanyị. Ọrụ ya bụ ilekọta ụmụnwaanyị na ịkpere obodo ekpere. Lee ihe ndị ọzọ dị omimi ọ gwara BBC Igbo maka ọkwa ya. Ọrụ a si n'aka Chris Sanctus Okereke na Chiemela Peters Mgbeahuru." 42740793,https://www.bbc.com/igbo/42740793,Victor Umeh ebidola ọrụ dịka Sinatọ Anambara Sentralụ,Onye bụbu onye-isi pati a na-akpọ All Progressive Grand Alliance (APGA) bụ Victor Umeh anarala ikike ka onye na-anọchite anya Anambra Sentralụ na ụlọ ome-iwu ukwu na Abuja.,"Victor Umeh, onye meriri ntuliaka Sineti ndị Anambra ebe mpaghara Etiti nke e mere n'ụbọchị 16 Jenụwarị, 2018 Victor Umeh meriri na mbinye aka e mere n' Anambra Steetị na Satọde nke izu ụka gara aga. Onye na-achị Anambra Steetị bụ Willie Obianọ nọ n'ụlọ ome-iwu ukwu n' Abuja mgbe e chere Victor Umeh iyi ọrụ nke mere ya onye otu ndị ome-iwu na Naijirịa. Ụlọ ikpe mkpekwa nke a na-akpọ Appeal Court chụpụrụ onye nọbu na ọkwa a bụ Uche Ekwunife nke Peoples Democratic Party (PDP), na onwa Decemba 2015. Ọ bụ Umeh wetara ikpe ejị maka ya chụọ Ekwunife, mana Ekwunife na-ekwu na ya anabatala mmeri o meriri ya ugbu a. Ụlọ ikpe ahụ nyere iwu ka e megharia mbinye aka e jiri nye Ekwunife ikike. A tụrụ votụ na local government asaa: Njikoka, Awka-North, Idemili-South, Dunukofia, Awka-South, Anaocha na Idemili-North." afirika-50806433,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50806433,Ebonyi State: Ihe mere ụmụnwaanyị ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe,Akụkọ pụtara na ụfọdụ agadi ụmụnwaanyị ruru otu narị sị na Agubia dị n'Ikwo gbaọtọ ma buru ngagharịiwe gaa n'isi ọchịchị Ebonyi steeti.,"Foto a abụghị nke ụmụnwaanyị Ebonyi Akụkọ sị na Ụmụnwaanyị a kpọrọ oku sị ka gọvanọ Dave Umahi nye iwu ka ndị uweojii tọhapụ ụmụ ha bụ ndị uweojii nwụchiri. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah sị na o juru ya anya ịhụ ụmụnwaanyị a na-eme ngagharịiwe. Ọ sị na a nwụchiri ụmụ ha maka ọgbaghara mere n'izuụka atọ gara aga ebe ha kpọrọ ụfọdụ ụlọ nakwa ụgbọala ọkụ. Na okwu ha ka nọ n'ụlọikpe ugbua. Ọ sị ngaghariiwe a na-egosi na ụmụnwaanyị a na-akwado ihe ọjọọ ụmụ ha na-eme. BBC Igbo kpọrọ gọọmentị Ebonyi Steeti mana ha sị na ha anụghị maka nke a. Ihe anyị ga-eji kwado mbite ego - Onyeisi ụlọomeiwu Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan kwuru na nkọwa Buhari nyere maka mbite ego ahụ doro ha anya Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akọwaala ihe ha ga-eji kwadoo arịrịọ maka mbite ego ọhụrụ bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari rịọrọ ha. Lawan nyere nkọwa a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Mọnde. Ọ kọwara na ha bụ ndị omeiwu ga-akpachapụ anya iji hụ na ego ahụ ga-aba n'ọrụ. Cheta na ụlọomeiwu nke gara aga ekweghị akwado ka Buhari bite ego ahụ. N'oge ahụ, Bukola Saraki onye bụ onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na ndị otu ya jụwara isi na gọọmentị agaghị ebite ego ahụ. Bukola Saraki akwadoghị mbite ego ahụ oge ọ bụ onyeisi ụlọ omeiwu Mana Buhari weghachiri arịrị ahụ azụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba. Lawan kwuru na ihe kpatara ndịomeiwu ji kagbuo atụmatụ mbite ego ahụ n'oge gara aga bụ maka na onyeisiala akọwaghịrị ha ọfụma. O kwuru sị, ""ugbua, ha akọwaala ya nke ọma. O doola anya ihe ha chọrọ iji ego ahụ mee."" Ụlọikpe akụchapụla akwụkwọ a gbara Ganduje A na-ebo gọvanọ Ganduje ebubo ịna aka azụ Ụlọikpe na Kano akụchapụla akwụkwọ otu onye ọkaiwu gbara gọvanọ Umar Ganduje gbasara ebubo iri ngari. Ọkaiwu ahụ chọrọ ka ụlọikpe nye iwu ka EFCC nyochaa Ganduje, mana ụlọikpa kụchapụrụ ya n'ihi na iwu Naịjirịa akwadoghi inyocha onye ji ọkwa Gọvanọ. Ọgụ adaala na Pako dị n'Aguda, Surulere Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi tigbuo na zogbuo dapụtara n'ebe a na-akpọ Pakọ, Aguda dị na Surulere Lagọs. Onye ntaakụkọ BBC bi nso n'ebe ahụ sị na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisi ndị ntoroọbịa na-alụ ọgụ. O kwuru na a lakwara ọtụtụ ngwongwo na ụlọ obibi ndị mmadụ n'iyi. Otu onye ọzọ bi na gburugburu ebe ahụ sị na ụlọọahị niile sị n'ebe ahụ agbachiela. Okwe Champions League agbaala N'egwuregwu, a tụọla akwụkwọ nke Champions League taa ị mata ndị ga-ezute ibe ha na agba nke otu egwubọọlụ iri na isii foduru. N'ime ya Borussia Dortmund nke Germany ga-ezute Paris Saint Germain nke France, Real Madrid nke Spain ga-ezute Manchester City in England. Atalanta BC nke Italy ga-ezute Valencia CF nke Spain. ClubAtletico de Madrid nke Spain ga-ezute Liverpool FC nke England. Chelsea FC nke England ga-ezute FC Bayern Munchen nke Germany. Olympique Lyonnais nke France ga-ezute Juventus nke Italy. Tottenham Hotspur nke England ga-ezute RB Leipzig nke Germany, ebe SSC Napoli nke Italy na ndị FC Barcelona nke Spain ga-agwu. N'otu aka ahụ ka Arsenal, Celtic nakwa Manchester United ga-amata ndị ha ga-agba n'asọmpị Europa League mgbe a ga-atụ akwụkwọ ha n'ehihie taa bụ Monde. A ga-amalite ịgba Champions League n'ọnwa Febụwaị afọ 2020. Ụmụejima anọ awuchie n'Enugwu Ụzụ tụrụ na Mother of Christ Specialist Hospital Enugwu ụbọchị Satọde mgbe otu nwaanyị mụrụ ejima anọ. Akụkọ anyị nụrụ bụ na Enugwu gbara ụmụaka ahụ nkiri ka akụkọ ha banyere obodo ahụ. Ụfọdụ n'ime ha gakwara ebe ahụ ịkụrụ ya bụ onyinye nke mkpụrụ afọ n'aka nne ha. Nna ụmụ ejima ahụ bụ Cajetan Adiele sị na ọṅụ jụrụ ya afọ ọkachasị ka isi nwụnye na ụmụ ya gbara iche n'udo. Adiele sị na nke a bụ afọ ime mbụ kemgbe ha gbachara akwụkwọ na ọnwa ọktoba 2018. Ọkụ agbaala n'Ibadan N'ime abalị sọnde ka ndị mmadụ na-ekwo ụra ka ọkụ tapịara ngwa ahịa dị nde kwuru nde nke ụmụ mmadụ n'Ibadan dị n'Oyo steeti. Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ndị 'Ibadan Electricity Distribution Company' wetere ọkụ bụ mgbe ya bụ ọkụ bidoro. Ọgbaaghara n'India N'ofesi, Onyeisiala mba India bụ Narendra Modi arịọla ka udo chiaa maka ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mba ahụ kemgbe abalị ise. Ndị mmadụ malitere ngagharị iwe maka iwu ọhụrụ etiri n'India bụ nke nwere ikike ka ndị abụghị ndị ụka alakụba nwee ike ịbata na India. Lee ka o si kwuru na Champions league afọ a Akwa akwụọla ọzọ n'OAU Ah! Onyenkuzi ọzọ bụ Victoria Adeniyi alaala mụọ nke mere ya onyenke atọ n'ime otu izuụka. Victoria tupu ọ laa mmụọ bụbu osote onyeisi na ngalaba mahadum ahụ na-amụ maka ejije bụ Department of Dramatic Arts. chetakwa na ndị omekome gbagburu Jerome Elusiyan abalị atọ gara aga. Tupu nke a eme, ahụrụ Dr Nicholas Igbokwe ebe ọzu ya dọ na ọfis ya. Dịka ọ dere n'akwụkwọ, onye na-ahụ maka mekọrịta Mahadum ahụ na ndị ọzọ bụ Abiodun Olanrewaju, o kwuru na "" ọ dị anyị nwute ka ọnwụ sịrị napụ anyị onyenkuzi ọzọ aha ya bụ Victoria Oluwaremilekun Adeniyi ka o ruchabeghị abali abụọ Jerome Elusiyan hapuru."" Akụkọ kọrọ na ọ bụ Victoria hazichara ihe ejije ndị mahadum ahụ gosiri abali anọ gara aga ma sokwara mee ngagharị ngosi ndị ọkankuzi mere ha jiri pụta ọgbọ na nzuko nke iri anọ na anọ nke mahadum ahụ. Ndị NIMC akwadoola abụbụ ọrụ Ndị ọrụ ngalaba Goomentị na-ahu maka njirimara bụ National Identity Management Commission ekwuola na ha adịla njikere igba abụbọ ọrụ maka ụgwọ eji ha na nleghara anya gọọmetị leghara ha. Onyeisioche ndị ọrụ a bụ Lucky Asekokhai gwara ndi ntaakụkọ na ha na-enye gọọmentị ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa desemba 2019 imegharị ọnodụ ha ma ọbụghi ya ka ha ga dọghachị azụ. Edgar Lungu sị Amerika laa be ha Edgar Lungu onyeisi mba Zambia Onyeisiala Zambia bụ Edgar Lungu agwala ndị Amerịka ka ha kpọrọ onye nnọchite anya ha n'obodo ahụ bụ Daniel Foote maka okwu okwuru megide nga ha turu ụmunwoke abụo maka mmeko nwoke na nwoke. Lungu sị na ọchọghị ndi dika foote na mba ha . Ma cheta kwa na iwu Zambia megidere mmeko nwoke na nwoke. N'egwuregwu Mgbe Manchester City mere Arsenal mmiri chukwu na be ha (Emirate) ụbọchị ụka Otu egwu bọọlụ Manchester City ejirila iwe gbanye ndị Arsenal kpakpando n'anya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ ha asataghị chaa chaa merie ha. Mmeri a budatara Arsenal n'ọnọdụ ndị nke itolu na Premiership. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46223756,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46223756,Ihere adịghị na nwoke ime nwaanyị mbọ - Onyedika,Ọ bụghịkwa sọsọ ụmụnwaanyị ma ka esi achọ mma.,Onyedika bụ nwoke Igbo kwuru na ọ ka mma na ọ na-eme ụmụnwaanyị mbọ bụ ihe na-amasị ya karịa ị ga zuo ohi. Ọ gwara BBC Igbo na ime mbọ na-enye ya ezigbo ego. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru n'ihe nkiri a. afirika-49085288,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49085288,Ministerial list: Ụmụ Naijiria akatọọla ndị mịnịsta ọhụrụ,"Ndị mmadụ akatọọla aha ndị mịnịsta ọhụrụ e wepụtara sị ọbụghị ihe a tụụ anya o kwesiri dịka ụmụnwaanyị,ndị na-eto eto nakwa ndị ma ihe a na-akọ n'akụkụ dị iche iche nke akụnaụba esoghị ya.","Onyeisiala Muhammadu Buhari zigarala Ụlọomeiwu Ukwu aha ndị ọ chọrọ dịka Mịnịsta ụbọchị Tuzde. Nke a na-eme ọnwa abụọ na ụma e dụchara Buhari iyiọrụ n'abalị 29 nke ọnwa Mee, 2019. N'ime aha mmadụ iri anọ na atọ, Buhari wepụtara, naanị mmadụ asaa bụ ụmụnwaanyị, ebe o nweghị onye pekarịrị afọ iri anọ na ise n'ime ha. Ka e si kee ọkwa mịnịsta na mpaghara,na mpaghara Ọzọ bụ, na agbanyeghị na Buhari kwuburu na ọ ga-eweta ihu ọhụrụ, mmadụ iri na abụọ (12)n'ime iri anọ na abụọ (42) ọ họpụtara bụ ndị rụburu dịka mịnịsta n'agba nke mbụ ya. Mmadụ isii n'ime ndị a bụbu gọvanọ. @BenUgbana jụrụ ma Buhari emezurukwara nkwa pasent ole ọ ga-enye ụmụnwaanyị ma o merie? @OlukolaE gogiri obi mwute dịka o jiri ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bụ mịnịsta na Naijiria manyere nke ndị Saut Afrika @Gistiofofo kwuru na ọ bụ ndị ụra gwụrụ n'anya, enweghị ihe ọhụrụ ha ga-ewepụta ka a họpụtara @IddyUdosen kwuru na ihe a hụrụ abụghị ihe a tụrụ anya. A na-atụ anya na ndị omeiwu ga-ebido ilebanye anya n'aha ndị a ụbọchị Wenezde. Cheta na ọ bụ mmadụ iri atọ na isii si na steeti iri atọ na isii dị na Naijiria mana o tinyekwuru na họpụtara si na mpaghara isii Naijiria nke mere ha mmadụ iri anọ na abụọ. Ndị ochie lọghachiri gụnyere: 1. Senator Chris Ngige- Anambra 2. Ogbonnaya Onu- Ebonyi 3. Geofrey Onyeama - Enugwu 4. Rotimi Amaechi- Rivers 5. Babatunde Fashola- Lagos 6. Adamu Adamu - Bauchi 7. Hadi Sirika - Katsina 8. Lai Mohammed - Kwara 9. Zainab Ahmad - Kaduna 10. Babatunde Fashola -Legọs 11. Abubakar Malami -Kebbi Ihu ọhụrụ so na ndị mịnịsta gụnyere: 12. Sharon Ikeazor -Anambra 11. Uche Ogah - Abia 12. Emeka Nwajiuba - Imo 13. Senator Godswill Akpabio -Akwa Ibom 14. Festus Keyamo -Delta 15. Sunday Dare -Oyo 16. Senator Tayo Alasoadura- Ondo 17. Olorunnibe Mamora - Lagos 18. Sadiya Farouk- Zamfara 19. Gbemi Saraki - Kwara 20. Isa Pantami- Gombe 21. Akpa Udo- Kros Riva Aha ndị chịburula dịka gọvanọ sokwa na ndị mịnịsta ọhụrụ a: George Akume na Rauf Aregbesola chịburu dịka onyeisiala Benue na Osun steeti 22. Rauf Aregbesola- Osun 23. George Akume -Benue 24. Timipre Sylva- Bayelsa 25. Adeniyi Adebayo- Ekiti Ndị mịnịsta ndị ọzọ: 27. Alhaji Sabo Nanono- Kano 28. Bashir Magashi - Kano 29. Baba Shehuri - Borno 30. Paullen Tallen -Plateau 31. Zubair Dada- Niger 32. Maryam Katagun -Bauchi 33. Ramatu Tijani - Kogi 34. Clement Agba- Edo 35. Mohammed Abdullahi -Nasarawa 36. Adamu Adamu - Bauchi 37. Goddy Jedi Agba - Krọs Riva 38. Osagie Ehanire 39. Musa Bello 40. Muhammed Mahmoud - Kaduna 41. Olamilekan Adegbite- Ogun 42. Mohammed Dangyadi-Sokoto 43. Sule Mamman- Taraba" afirika-44646227,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44646227,"Inec akwadola ọnọdụ 119,973 maka ntuliaka 2019","Onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ihazi ntuliaka nke a kpọrọ Inec n'aha ịchafụ bụ ọkammụta Mahmood Yakubu ekwuola na Najiriịa ga-eme ntuliaka na-abịa n'ebe mbinyeaka(pooling booth) 119,973 dịka a ga-ekpokọta mpụtara ha na wọọdụ 8,809.","E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015 Inec kwuru na ntuliaka maka ọkwa onyeisiala ga-adị n'abalị 16 nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2019, ebe nke ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti ga-adị n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị Yakubu kwuru na Inec adịrịla njikere ime ntuliaka nke a na-atụ anya na ihe dịka mmadụ nde iri asatọ debanyereala aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ga eso tụọ. Ọ sịrị: ""Ntuliaka abụghị mmemme kama ọ bụ ihe nwere usoro nke ga-ebiri ọkụ tupu ụbọchị ntuliaka. Nkwado ntuliaka na-abịanụ na-ebido na ngwucha ntuliaka e merela."" ""O bụ n'ihi nke a, anyị ebidola na ntuliaka 2019 site na iwepụta atụmatụ site n'afọ 2017 rue 2021."" O kwuru na ndị tụnyere ọnụ n'okwu gbasara atụmatụ a gụnyere ndị pati, otu na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye. Cheta na Muhammadu Buhari ekwupụtala na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha otu APC dịka ọtụtụ na-eche na o nwere ike pati ya agaghị enye onye ọzọ karịa ya ohere ịnọchite patị ha. Atiku Abubakar, Donald Duke, na ndị ọzọ nọ na pati ọzọ na-azọkwa ọkwa onyeisiala Naijiria Ndị ntorobia pụtakwara ịzọ ọkwa ahụ gụnyere onye bụbu otu na ndị isi n'ụlọakụ etiti a kpọrọ 'Central Bank' na bekee bụ Kingsley Moghalụ, onye ji okwu akpalite mụọ ndị mmadụ(motivational speaker) bụ Fela Durotoye, nakwa Omoleye Sowere, onye nwe Sahara Reporters. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 51178112,https://www.bbc.com/igbo/51178112,Ọgba Mbọ: Ịrụ ọrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn,Jane bụ ezigbote ọgba mbọ dịka ọ bụ nwaanyị ji ọrụ ido ụlọ na-azụ ezinaụlọ ya nri.,"Ọ sị na ọ bu ọrụ ọ hụrụ n'anya ma bụrụ ihe o ji obi ọcha arụ. N'ihe nkiri a, Jane kọwaara BBC Igbo etu o Jiri malite ọrụ a. O kwukwara na agbanyeghi na ụmụ ya asaa na di ya anwụọla, be ya juru eju, dịka o nwere mmadụ iri na ise ọ na-azụ na be ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55467589,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55467589,Igbo Arts: Etu m si eji uli Igbo emepụta akwa ọgbaraọhụrụ bụ sọ mma - Uchechukwu Ezeemo,Omenala Igbo were ihe nka dị icheiche e ji mara ya ma n'oge gboo ma n'oge ugbua.,"Uli bụ otu ihe ụmụagbọghọ ji achọ onwe ha mma n'oge mbụ, mana ọ dị ya bụ ihe a laala ugbua. Mana nwaokorobịa a bụ Uchechukwu Ezeemo achọpụtala ihe ọzọ e ji ya eme. Uchechukwu Ezeemo ji uli emepụta ụdị akwa dị iche iche bụ sọ mma. O gosiri BBC Igbo etu o si eme nke a. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru." afirika-43208188,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43208188,Ipob sị na Okorocha na-achọ uru isi ya,"Na iza okwu gọvanọ na achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru na nkata ya na BBC Igbo kpara, Ipob sị na ha achọghị ibute agha na Naịjirịa dika ha sị na Okorocha si kwuo.",Ipob asaala Okorocha Okorocha kwuru na Igbo na Ipob abụghị otu ihe Ha gakwara n'iru si na uche ha gọvanọ Okorocha esoghị na ndị ha (Ipob) na-akpọ onye Igbo. BBC Igbo kpọrọ otu na ndị na-ekwuchitere Ipob bụ onye akpọrọ Ụkọchukwu Peace n'elu ekwenti. Peace si na Ipob bụ otu udo na-achọghị nsogbu ọbụna. Gee ihe ndị ọzọ ọ gwara anyị n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Rochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe mba-uba-53850187,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-53850187,Ịgụ egwu ọ ga-enyerenwu ọnọdụ ahụike gị aka?,"Ịgụ egwu ga-akpalitenwu mmụọ anyị, mana nchọpụta ekwuola na o nwekwara ike inyere ọnọdụ ahụike anyị aka.","O nwekwara ike inyere nkuru ume onye akpaume na-enye nsogbu aka, ma nyerekwa onye nwere ọrịa nchefu a na-akpọ ""dementia"" aka idi ọrịa na-arịa ha. N'ime ihe ruru afọ iri abụọ gara aga, ndị nnyocha agbaala mbọ ịchọpụta ihe a ga-ejide aka sị na ọ bụ akparamagwa maọbụ eburupụtaụwa ahụ jikọrọ egwu na ahụike. Ọkammụta Daisy Fancourt, si na mahadum University College London, kwuru sị na ọtụtụ ihe na-agbanwe n'ahụ mmadụ ma ọ na-agụ egwu: ""Nke a nwereike ịgụnye mbutu n'ihe na-ebute mgbakasị ahụ, nke a kpọrọ cortisol. Anyị na-ahụkwa ihe dị iche n'ọnọdụ endorphin nke na-emetụta mgbanwe ọnọdụ anyị."" Uru dị iche iche ọ bara Ọkammụta Fancourt emeela nnyocha dị iche iche gbasara uru ịgụ egwu bara, ma kwuo na ọ bara uru dị iche iche. A na-eji ịgụ egwu agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ ""Ịgụ egwu bụ ihe e ji enyere ọnọdụ ahụike dị iche iche. Ọtụtụ ihe mejuputara ịgụ egwu. Ịgụ egwu gụnyere igosiputa ihe na-aga gị n'uche, nke anyị ma dịrị ọnọdụ ahụike ụbụrụisi mma. Ọ na-enyekwa aka izi mmekọrịta nwereike iwebilata ọnọdụ mmadụ iche na ọ bụ naanị ya kwụ."" O kwuru na ige egwu nwere ọtụtụ uru ọ baara ahụike. ""N'ime ndị na-aga emume ebe a na-agba egwu, n'agbanyeghi maọbụ egwu tara nchara maọbụ nke 'rock' - anyị chọpụtara na o buturu ọnọdụ mgbakasị ahụ. Nke a gosiri na ọ na-arụ ihe dị iche iche."" Akwụkwọ ndị Canterbury Christ Church University, UK, wepụtara gosiri na ""Ịgụ egwu nwereike inyere ndị nwere ọrịa ụbụrụ na ọrịa ndị ọzọ dị iche iche aka"". Ndị nnyocha tinyekwuru sị ""ịgụkọ egwu n'ọgbakọ karịrị otu onye nwere ọtụtụ uru ọ bara n'inyere aka na mgbake ndị nwere ọrịa ụbụrụ"". Ntụgharị uche Annabel bụ okwe ukwe bi na mba Jamini, kwuru ihe ịgụ egwu mere n'uche nakwa ahụ ya. Ịgbakọ wee na-agụ egwu dị ndị agbụrụ Tamil Hindu mkpa ""Mgbe ọbụla m na-agụ egwu, ọ na-adị m ka oge ntụgharị uche. M na-etinye onwe m n'ime egwu ahụ. Ọ na-eme ka ahụ dị m mma."" Ọ na-eji awa atọ agụ egwu kwa ụbọchị Tọzde ọbụla. ""Ị na-eji ahụ gị niile agụ egwu. Nke a bụ ihe m na-ekwu mere na anaghị m aga n'ụlọ mmegharị ahụ."" Ọrịa nchefu (Dementia) A na-eji abụ nakwa ịgụ egwu dịka otu usoro e ji enyere ndị na-arịa ọrịa dementia aka. Ndị nnyocha ekwuola na ịgụ egwu na-enyere ọnọdụ ahụike ụbụrụ aka ""Mgbe anyị na-agụ egwu, e nwere akụkụ ụbụrụ anyị ọbara na-aka agaru - akụkụ ndị a na-akpọ precortical - ha bụ ndị nke na-afọkarị n'ụbụrụ onye na-arịa dementia mgbe ọrịa ahụ kpụrụchara akụkụ ndị ọzọ. Ebe ahụ bụ ebe ndị metụtara etu ihe si emetụta mmadụ,"" ka Dkt. Simon Opher kwuru. Dkt Opher si obodo Cheltenham dị n'Ịngland, kwuru sị na ige egwu ""na-akpọte ndị na-arịa dementia ma mee ka uche ha dịrị n'ihe a na-eme."" Uru Mind Song bụ ụlọọrụ efu dị na mba Briten na-eziga ndị ọgụ egwu ha ka ha gaa n'ụlọ ebe a na-elekọta ndị merela agadị, ka ha nwee ike ikpalite mmụọ ndị agadị ahụ ka ha nwee ike na-agụ egwu. Ịgụ egwu na-enyerekwa ndị nwere ọrịa akpaume aka ""E nwere uru ndị ị ga-erite site n'iso ndị mmadụ gụọ egwu. Ọtụtụ ndị na-elekọta ndị agadị na-agwa anyị na ha na-anọ n'ọnọdụ obi aṅụrị ruo echi ya,"" ka Maggie Grady, onye na-ahazi iji egwu agwọ ọrịa nke ngalaba a kwuru. Mind Song na-ahazikwa nkuzi egwu maka ndị na-arịa ọrịa akpaume site n'asthma ruo kansa nke akpaume. ""Ha bịachaa mmụta ihe ruru ugboro ise maọbụ isii, ụfọdụ ndị anyị na-akuziri na-agbaketu."" Ule a na-akpọ ""Peak flow"" na-egosi etu ikuku ga-esinwu n'akpaume kupute ọsịsọ - nke bụ otu ụzọ e si ama ndị iku ume na-ara ahụ. Ike akpaume Ọtụtụ emume ndị ụka gụnyere ịgụ egwu Ọ bụghịzị ihe ịtụnanya na ndị ọrịa akpaume na-enye oke nsogbu na-eji ịgụ egwu enyere ọnọdụ ha aka. Colin na-arịa ọrịa a kpọrọ ""idiopathic pulmonary fibrosis"", bụ ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ ma na-egbu ndị na-arịa ya n'ime afọ atọ. Mana n'agbanyeghi etu ọrịa ahụ si jọọ oke njọ, o kwuru na ịgụ egwu na-enyere ọnọdụ ya aka. ""Mụ na ihe ruru mmadụ 16 na-agụ egwu. O nyerela m aka ikuzi ume karịa etu m si emebu. M na-eme nnyocha maka ọnọdụ akpaume m oge ọbụla ma chọpụta na o mewela ọfụma."" Mmiri ọgwụ ahụ Ịgụ egwu na-eme ka ahụ nyụpụta endorphins, bụ nke na-eweta obi ụtọ. Ịgụ egwu na-eme ka anyị kuba ume, nke na-akwalite mgbasa ọbara n'ahụ ma na-ewelite ọrụ endorphins na-arụ. Ndị nnyocha kwuru na ịga n'ọgbakọ ebe a na-agụ ma na-agba egwu na-enyere ahụike anyị aka Ọ dị ka etu endorphin si agbagharị n'ahụ ma anyị chịa ọchị maọbụ rie chọkọleti. Otu nnyocha gosiri na ị soro ndị mmadụ gụkọọ egwu ihe ruru nkeji 40, na cortisol - bụ mmiri ọgwụ mgbakasị ahụ - na-ada ọsisọ karịa etu ọ gaara ị na-eme. Ogo cortisol anyị na-eru na-ada n'ebe ngwụcha ụbọchị, mana ịgụ egwu na-enyere ya aka ịgasi ike. Nchọpụta gosiri na ndị na-agụ egwu na kwaya na-aka amụpụta mmiri ọgwụ ahụ a kpọrọ oxytocin, bụ nke a na-akpọ ""mmiri ọgwụ ịhụnanya"" mgbe ụfọdụ. Anyị na-anyụpụta ya ma anyị makụọ, ọ na-emekwa ka ntụkwasị obi na mmekọ mmadụ na mmadụ mụbanye. Nke a nwereike ịkọwa ihe mere ndị na-agụkọ egwu na kwaya ji abụkarị ma na-anọkọkarị ọnụ ọtụtụ oge. Ịgụ egwu na-ebutekwa nnyụpụta dopamine, bụ otu ihe na-agwa ụbụrụ egwu. A ma ya dịka ihe na-ewepụta ""obi ụtọ"" ma ihe dịka iri nri maọbụ ịṅụ ọgwụ ike kpalie ya. Nnyụpụta ya na-adị ka nkwado nakwa mkpalite mmụọ. Enyemaka teknụzụ Ndị achọghị ịpụ n'ụlọ ha nwereike isonye ndị na-agụ egwu n'elu kọmputa, ha na-agbalị ime ka ọ dị ka ebe mmadụ so ọtụtụ ndị mmadụ nọ otu ebe na-agụ egwu. Atụmatụ a na-akpọbata ọgụ egwu ndị ọzọ si na mpaghara ụwa dị iche iche ma jiri teknụzụ jikọọ ha. Eric Whitacre bụ onye riterela nturuugo Grammy maka ide na ihazi egwu nwere otu kwaya nke a na-agụ n'elu ịntanetị. Ndị na-agụ egwu n'akukụ ụwa dị iche iche ga-agụ nke ha ma zibata ya, a hazie ya ọfụma ma mee ya ka ọ bụrụ otu nkwepụta. Mgbochi Ndị na-eme nnyocha na-akọwa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke isonye otu ndị na-ekwe egwu na-ebute nwekwara ike iwedata mmadụ ịnọrọ onwe ya. Ịgụ nakwa ịgwa egwu bụ ezigbo omenala ọtụtụ ndị N'adịghị ka ụmụaka na-amalitekarị ịgụ egwu n'ụlọakwụkwọ, ọ na-ara ọtụtụ ndị okenye ahụ isonye otu egwu. MJ Paranzino kara ndị mmadụ obi were sị: ""Oge mbụ mmadụ na-agụ egwu na-adi ka ụbọchị mbụ mmadu malitere ọrụ. Ọ gagahị adịcha gị mfe,ị nwereike na-eme ihere. Ọ bụ ịka obi ka eji aga n'ihu. Mana, ewezụga ihere na ihe ndị ọzọ nọchiri gị n'ụzọ, ị ga-achọputa ọwa ọhụrụ mara ezigbote mma. Once you get over those inhibitions, you will discover an amazing new world,""" afirika-44102889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44102889,Nsogbu ọgwụike metutara mmadụ niile - Emzor,"Na mkparịtauka ndị Emzor na ndị ntaakụkọ nwere taa, onye nwe Emzor bụ Stella Chinyelu Okoli kwuru na codeine nwere ọrụ ọma ọ na arụ na ahu mmadụ mana ndị mmadụ ne-eji ya eme ọgwụike, ma kwuo na nsogbu sitere na ya metụtara mmadụ niile nke mere aka niile ji kwesi ikwado ịhụ na ahụrụ ihe a ga-eme gbasara ya.","Stella Chinyelu Okoli kwuru na ụlọọrụ na-eme etu okwesiri Ndị Emzor kwuru na onweghị mgbe ha jiri nụpụ isi maọbụ ghara ịkwanyere ndị npaghala gọọmentị na-ahu maka nrị na ọgwụ bụ NAFDAC ugwu ruru ha mgbe ha bịara ụlọọrụ mgbe ha akụkọ banyere codiene ndi BBC mere pụtara. Cheta na nkọwa NAFDAC bụ na ihe ha jiri gbachie ụlọọrụ Emzor na ndị ọzọ bu maka na ha e nyeghi ha nkwado ka o si kwesi. Oriakụ Okoli gara n'ihu kwuo na ịṅụ ọgwụ ike bụ ihe ekwesiri ijiri me ezigbote mkpa, okachasị etu o siri emetụta ndị ntoroọbịa. O kwuru na Emzor na-enye aka maka ihe metụtara ndị ntoroọbịa site na ""Chike Okoli Centre for Entrepreneurship"" nke dị na mahadụm Nnamdị Azikiwe n'Ọka na ""Emzor Wellness Club"" bụ nke metụtara ndi nọ na ụlọakwụkwọ praimari nakwa sekondiri. Mana na ajụjụ na azịza sotere okwu ndi Emzor, otu onye ntaakukọ jụrụ etu mgbachi a siri metụta ha, Emzor sara na ha amabeghị, maka na onwere ọgwụ ha tinyere ebe a na-emepụta ha, nke ha amabeghị ọnọdị ha ugbua. Okoli gakwara n'ihu kwuo na mmetụta di na ụdi na ụdị, na ọbughị so ego na akụnaụba ka ihe metụtara. Codeine, ọtọmegbum Na ozi NAFDAC zipụrụ maka mgbape Emzor na ndị ọzọ mgbachi a metụtara, he kwuru na ha dara ha iwu ma na-asi ka Emzor kpọta onye ọrụ ha ihe onyonyo a gosiri ka ọ na-ere ọgwụ a. Emzor sara sị na ha amabeghi ka adara ha nha maọbụ adaghị ha. N'okwu onye ọru ha, ha kwuru na ha chụru ya n'ọrụ ma gakwa n'ihu nye ndị uweojii ihe niile ha ma gbasara ya, nke mere ha jiri sị na ọ bụ ndi uwejii ka ọ dị n'aka. Cheta na NAFDAC gbachịrị ụlọọrụ Emzọr na ụlọọrụ abuo ndị ọzọ na-emepụta codeine (Bioraj na Peace Pharm) ndị ọrụ ha pụtara na ihe onyonyo BBC mere maka mpụ di na orire codeine. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44750114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44750114,INEC ga-akwụsị idenye aha maka akwụkwọ ntuliaka n'ọnwa na-abịa,Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ Independent National Electoral Commision (INEC) na Bekee kwuru na ha ga-akwụsị idenye aha ndị mmadụ maka inye ha akwụkwọ ikike iji mee ntuliaka n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ afọ a.,"Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha ma dịkwa njikere maka ntuliaka Ndị INEC kwuru n'ime akwụkwọ ozi ha zipuru na ha na ndị ọnụ na-eru n'ihe gbasara ntuliaka etinyela ọnu na-etu esi eme ndenye aha maka ntuliaka nke 2019, wee kpebie na ha enyela ohere etu o si kwesị maka idenye aha nakwa ihe ndị ọzọ banyere ịnata akwụkwọ ikike a. N'agbanyeghi na a ga-akwụsị ime ndenye aha n'Ọgọstụ, INEC kwuru na a ka ga na-anata akwụkwọ ikike a ruo izuụka tupu emee ntuliaka 2019, nke ga-eme n'ụbọchị 16 nke Febụwarị. BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ maka etu ha si dịrị nkwadobe maka ntuliaka nke 2019 mgbe na-adịghị anya. Lee ihe ha kwuru ebe: Ndi Igbo zara azịza maka ntuliaka 2019 Cheta na ụloomeiwu tinyere ọnụ n'usoro e ji eme ntuliaka na Naịjirịa ga-emegide ndị mmadụ wee chọọ imegharị ya. Gụọ maka nke ahụ ebe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43151467,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43151467,Yobe steeti: Ndị agha agbapụtala ụmụakwụkwọ ndị a tọrọ,"Dịka Gọọmenti Yobe Steeti siri kwue, ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị iri ise na-efu efu ka ndị e chere na ha bụ Boko-Haram wakpochara ụlọakwụkwọ GGSTC nke dị na Dapchi na steeti ahụ ụbọchị Monde","ụmụakwụkwọ ndị agbapụtara nọ n'aka ndị agha Naijiria ndị Agha Naijiria Akwụkwọ ọzi ọnụ na-ekwuchitere Steeti ahụ bụ Abdullahi Bego wepụtara kwuru na ndị agha ala anyị zọpụtara ụmụakwụkwọ e kwughị ọnụọgụgụ ha n'aka ndị oyiegwu tọrọ ha n'abalị ụnyaahụ. Bego gara n'ihu kwue na ụmụakwụkwọ ndị ahụ azọpụtara nọ n'aka ndị agha ala anyị. Ọ sịrị: ""Ụmụaka ụmụnwaanyị ndị a azọpụtara nọ n'aka ndị agha Naijiria. Anyi ga-ewepụta nkọwa ole ha dị na ọnọdụ ha ma oge rue."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye ntaakụkọ BBC bụ Chris Ewokor kwuru na o dobeghị anya ma ọ bụ ụmụaka niile na-efu efu ka a chọtara, ebe ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ ruru otu puku. Ma ka osi na dị, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari enyela ndị agha iwu ka ha mee gbanụgbanụ ga chekwa ụlọakwụkwọ ahụ." 42935669,https://www.bbc.com/igbo/42935669,Otu goolu Aubameyang nyeala Aresenal aka imeri Everton,Onye ego eji go ya kachasi na Arsenal bụ Pierre-Emerick Aubameyang zikọrọ ihe eji were nde pound iri ise na atọ zụta ya na aka Borrussia Dortmund na sọmpị ha na Everton pịara ụnyahu.,"Pierre-Emerick Aubameyang bụbụ onye kachasi nye goolu na Bundesliga. Onyere goolu iri ato na otu (31) Egwuregwu a bụ nke mbụ Aubameyang na gbara ndị Arsenal. Arsenal meriri 5-1. Aubameyang nyere otu goolu na sompị a bu nke izizi o na agbara ndị Arsenal. Na okara nke mbụ na sọmpị a, Arsenal zikọrọ Everton ihe ihere ka ha nyere ha ọkpọ goolu anọ ha azataghi. Na okara nke abuọ, nyere otu goolu site na aka Dominic Calvert-Lewin, mana egwu nọzị na ngwucha mgbe ahụ. Aaron Ramsey kpiakara onụ gooolu ndi Everton ugbolo atọ. Nke bu mbụ o na enye udiri goolu a. Theo Walcott gbakwara bọọlụ a unyahụ na nnaghachite ya na Arsenal, ma ọ Laurent Koscielny bu onye ọzọ gbakara net ndị Everton." afirika-43731551,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43731551,Akụkọ kachasị taa: Mmadụ 257 anwụọla n' Ọlgeria,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Ọnụọgụgụ Naịjirịa na-achụ nde narị abụọ Akụkọ apụtala na ọnụọgụgụ Naịjirịa chọrọ iru mmadụ nde nari abụọ. Nke a bụ ọnụọgụgụ ọhụrụ otu na-ahụ maka ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ National Population Commission wepụtara. Nke a ga-eme Naịjirịa mba asaa kachasị n'ọnụọgụgụ n'ụwa niile. Akpụpụla onye Denmark gburu nwunye ya na nwa ya na Legos ụlọikpe Akpụpụla Peter Nielsen ụlọikpe dị na Lagos Ọ bụ nwoke onye Denmark gburu nwunye ya Zainab na nwa ya nwaanyị ya akpọrọ Petra dị afọ atọ na Legos. Ụgbọelu ndị agha Algerịa kpọkasịrị taa. Ihe ruru mmadụ 257 anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere taa na mba Algeria. Ndị ọrụ mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa n'Algeria kwuru na ndị ahụ nwụrụ nọ n'ụgbọelu na-ebu ndị agha tupu ụgbọelu ahụ akpọkasịa taa. N'egwuregwu N'asọmpi Uefa champịọns ụnyaahụ, ihe ịtụ n'anya mere Barcelona mgbe ndị Roma gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa champịọns. Ndị Barcelona jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Roma n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ, ebe Roma n'ihe iju anya jiri ọkpụ atọ chara acha merie ma gbapụ ha. Ajụjụ a bụrụ, ihe mere ndị Barcelona onwere ike ime ndị Real dịka ha ga-ezute ndị Juventus n'abalịa. N'aka nke ọzọ, Bayern Munich ga-ele ndị Sevilla bụ ndị ha jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie n'ụkwụ nke mbụ ọbịa n'ụkwụ nke abụọ taa. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017. Mama ejima atọ na-ahụbeghi di ya Akụkọ ndị ga-amasị gị" 45886187,https://www.bbc.com/igbo/45886187,Bianca Ojukwu: APGA ga-ata ahụhụ ihe mere na ntuliaka imeụlọ ha,"Bianca Ojukwu, nwunye Dim Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu nwụrụ anwụ, ekwuola na otu APGA ga-enweta ụgwọ ọrụ ihe ha mere na ntuliaka imeụlọ ha na ntuliaka na-abịa.","Bianca Ojukwu bụ nwa aka chịbụrụ Gọvanọ Anambara steeti ochie bụ Christian Onoh Bianca zọrọ ọkwa onye ga-anọchiteanya ndị Anambara-Saụt n'ụlọomeiwu nke ukwu mana Nicholas Ukachukwu meriri ya. O kwuru na e ji aghụghọ kpapụ ya na ndị ọzọ so bido pati ahụ. N'akwụkwọ ozi nke o binyere aka, Bianca boro ebubo na pati ahụ abanyela n'aka ndị ọjọọ nke mere na pati ahụ na-achọzị ikpula ka ero. ""Dịka otu onye so nọrọ n'isioche nlekọta pati, ọ na-ewute m na aka ndị ọjọọ akparala pati anyị. ""Taa, APGA na-atụ n'ume, ebe aha ya dakpọcharala. ""Nke a ga-enyerịrị ha ntaramahụhụ na ntuliaka na-abịa."" Mana ọ kpokuru ndị e mejọrọ na ntuliaka imeụlọ ahụ ka ha ghara ịhapụ pati ahụ n'iwe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43068862,https://www.bbc.com/igbo/43068862,Udọ jịkọrọ Oliseh na Fortuna Sittard adọbiela,Sunday Oliseh bụ onye nkuzi otu bọọlụ Fortuna Sittard n'ala Nertherlands kwuru ụnyaahụ na ọ kwụsiri ọrụ n'otu bọọlụ ahụ.,"Oliseh sonyere Fortuna Sittard ka onyenkuzi na Disemba afọ 2016 Ọ sịrị na ihe e jirir chụọ ya n'ọrụ bụ na o kweghị ime ịhe megidere iwu n'otu ahu. Fortuna Sittard kwukwara na Oliseh bụ onye n'enye mmadụ niile nsogbu n'orụ ya, na ọ bụ n'ihi nke a ka ha jịrị chụọ ya. Ha nyere Claudio Braga bụ onyenkuzi otu nke ụmụaka ka onye ga-anọchịte anya tupu achọta onye ọzọ. Cheta na n'ọnwa Jenụwari, Fortuna Sittard gọrọ agụgọ na ha achụghị Oliseh n'ọrụ. Lee ihe Oliseh dere n'elu igweokwu Twita: End of Twitter post, 1 Fortuna Sittard kwuru nke ha kwa n'elu ya bụ igwe okwu Twitter:" afirika-46585330,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46585330,Sex for marks: Onyenkuzi OAU ga-aracha nga afọ abụọ,"Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Richard Akindele nọ na-achọ idina nwa akwụkwọ ya tupu o bufee ya n'ule, ga-aga mkpọrọ afọ abụọ.","OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Ọkaikpe Maureen Onyekenu, nyere iwu a n'ụlọikpe dị n'Ọshụn steeti, ka Akindele na-akuzi na mahadum Obafemi Awolowo (OAU), ka Akindele mechara kwenye na o mere Monica Osagie bụ nwa akwụkwọ ya, ihe e boro ya. Onyekenu kwuru na Akindele ga-anọ n'ụlọmkpọrọ dị n'Ilesha, maka ụdịrị ihe o mere, nke o kwuru ""na-amụbanye n'ime obodo a."" Onyekenu kwukwara na e kwesịrị inwe onye ga-ama n'ọnya, ka ọ kuziere ndị nkuzi na-emeso ụmụakwụkwọ ha ụdịrị omume a na mahadum, mụrụ akọ. Francis Omotosho bụ ọkaiwu Akindele, rịọburu ụlọikpe arịrịọ ka ha gbaghara ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43858572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43858572,Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri na mba Amerịka,Ndị uweo ji kwuru na otu nwoke gba ọtọ egbuola mmadụ anọ n'ụlọoriri dị n'obodo Nashville na mba Amerịka.,"Ndị uweoji chọtara egbe eji wakpo ụlọọriri a Nwoke ahụ tibara n'ime ụlọoriri ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'Antioch ma malite ị gba ndị mmadụ egbe. Mmadụ anọ ndị ọzọ merụkwara ahụ tupu onye ọzọ na-eri nri ebe ahụ anapụ ya egbe oji, o we gbapụ ọsọ. Ndị uweoji enyela aha nwoke ahụ ka Travis Reinking dị afọ iri abụọ n'itoolu bụ onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-achọ ya. End of Twitter post, 1 Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49672616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49672616,Election Tribunal: Ọkpụrụkpụ okwu ise ụloikpe ntuliaka ji nye Buhari mmere,Ọ ka na-agbagwoju ụfọdụ anya ihe mere ụlọikpe pụrụ iche jiri nye onyeisiala Muhammadu Buhari mmeri ka ọ nọsie ike dịka onyeisiala Naiịjrịa.,"Ụlọikpe ahụ nke Mohammed Garba nọ n'isi ya kwuru na PDP na Atiku achikọtaghị okwu ha na ndị akaebe ha kpọtara ọnụ. PDP kpọrọ ndị akaebe 62 maka ya bụ ikpe. Ihe a bụ okwu ise gbara ọkpụrụkpụ ha jiri welie ya aka elu n'Abuja ụnyahụ bụ Wenezde: N'ihi nke ka ụlọikpe ji wezụga ya bụ ikpe dịka okwu enweghị isi. Ndị so kpee ya bụ ikpe bụ Jọstis Abdul Aboki, Joseph Ikyegh, Samuel Oseji, nakwa Peter Ige. Akụkọ ga-amasị gị" media-48029230,https://www.bbc.com/igbo/media-48029230,Okorocha: M banye Sineti Igbo niile ga-ama na onye kpọrọ akpọ abịala,Rochas Okorocha gwara BBC Igbo na ọ naghị aga ụlọomeiwu maka ezumike nka.,"Ọ sị na-agbanyeghị na-onwere etu obi na-eme ya makana onwere etu ọ dị na mmadụ ga-achịcha steeti gawa ịchị mpaghara steeti ahụ, o chọro ịga nọchịte anya Imo steeti n'ala Igbo etu pụrụiche makana ""Imo enwebeghị onye nnọchịte anya kpọrọ akpọ."" Gee ya ntị. Akuko ga-amasi gị" afirika-43436619,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43436619,Lagos: Katakata na-ada n'Ọjọta dị na Lagos,A na-atụ ụjọ na o nwere ndị nwụrụ dịka ọgbaghara bidoro n'Ojota ụnyaahụ ebe ndị ntorobịa abụọ nwere nghọtahie ma bido ịlụ ọgụ.,Ọtụtụ ndị na-eme njem na-aga Ojota ịbanye ụgbọala na-aga ebe dị icheiche Akụkọ kwuru na itu onye nime ha nke a na-akpọghị aha ya tiri nwanne ya ihe maka ya bụ nghọtahie. E kwuru na ndị ntorobịa ndị ọzọ tinyere aka ịlụsọ onye tiri nwanne ha ihe nke butere ọgbaghara ahụ jiri nwuru ọkụ pụta n'ụtụtụ taa. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Legos steeti e kwuola na ọgbaghara ahụ mere ma kwuo na ndị uweojii awụchiela ebe ahụ. E kwuru na ọtụtụ ọgbatumtum ka e mebiri n'ọgbaghara ahụ. Anyị ga-ewetara gị akụkọ ka ọ na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: media-50997777,https://www.bbc.com/igbo/media-50997777,Blind Mechanic: Ekpuru m isi mana onweghị onye ka m arụ ọrụ inginia,Ihe dị egwu bụ ihe BBC Igbo chọpụtara n'ebe inginia Emeka Abugu kpuru isi nọọ.,"Ọ gaara anyị na ọrịa akpata a na-agwọchaghị ọfụma mgbe ọ dị afọ ise bụ ihe mere o ji kpuo isi. Mana agbanyeghị nke a nwoke a alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ asaa. Kirie ka o si arụziri ndị mmadụ ụgbọala, ọgba tụmtum, igwe na-enye ọkụ latrik nakwa taya mebiri emebi. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a." afirika-46990483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46990483,Oby Ezekwesili: Naanị ndị chọrọ ikwenye n'ụgha kwenyere n'ebubo ACPN,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Ngwa ngwa Ezekwesili mere ka owee anya, na ya achọghịkwa ịzọ ọkwa onyesiala na 2019, onyeisi pati ha bụ Ganiyu Galadima boro Ezekwesili ebubo ịji ọkwa ahụ arịọta ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ego. Galadima kpọkwara ya oku ka ọ bịa kọwa ka ha siri mefuo ego pati ahụ na ọsọ achụmta vootu. Mana n'ọsịsa ya n'igwe okwu Twitter, Ezekwesili kwuru na o nweghị eziokwu dị n'ebubo ndị ndu pati ACPN boro ya. End of Twitter post, 1 O kwuru na mkpebi pati ya ịdọnyere onye na-azọ n'aha APC ukwu ozigbo ya rituru gosiri na ha bụ ndị iji ọndọọndọọ achụ mkpa ha. Ezekwesili kwuru na ọsọ achụmnta vootu ya bụ nke ya kwụwara aka ọtọ were eme n'ihi nkwenyere ya na ime ihe dịka o kwesịrị. Ọ bụ ntozu ọ bụghị agbụrụ ka m na-ele anya - Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari gara achumta vootu na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ụnyaahụ. Njem ahụ kpọgara ya Anambara na Enugwu steeti ebe ọ gara mgbape ụlọ ozu onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa bu Nnamdị Azikiwe. Buhari si Ọnịcha gawa ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'ime Enugwu ebe o nọ metụ ile n'okwu banyere mkpagbu ụfọdụ na-ebo ya na o na-emegbụ ndị Igbo. Buharị sị na nke a abụghị eziokwu n'ihi ya na enye Igbo oke nke ruru ha. N'okwu banyere ndị isi ndi ọrụ nchekwa, nke ọ bụ sọsọ ndị ugwu nọ n'ọkwa, Buhari kwuru na ọ bụ ntozu ka ya na-ebu n'uche nwere na-enye ọkwa. Gọọmenti etiti akatọla okwu Sineti kwuru banyere Bọọjetị 2019 Gọọmentị etiti akatọọla okwu ndị omeiwu kwuru banyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2019. Ngalaba na ahụ maka bọọjeti n'ụlọ omeiwu nke ukwu kwuburu na ufọdụ ihe adabachaghị dị na ya bụ bọọjetị, Mana Maazị Ben Akabueze, bu onyeisi ngalaba na-ahu maka bọọjeti, kwuru ha zigara ndị omeiwu a okwu a metutara ozi ime ka ha mata na ya bu bọọjeti kwụ ọtọ. Mgbape ụlọ ọrụ gọọmentị Amerịka ka bụkwa ihe a na-adọ ndọrọndọrọ Onyeisiala Trump na onyeisi ụlọ o,eiwu nke obele bụ Nancy Pelosi na-ama aka onye ga-ebu ụzọ tabie anya Ndị omeiwu ukwu nke mba Amerịka agbajọla atụmatụ abụọ ga-enye aka ịkwụsị mgbachi ụfọdụ ụlọ ọrụ gọọmentị. Onweghi atụmatụ abụọ ahụ nwetere ndị nkwado ruru mmadụ iri isii, bụ ọnụọgụgu ọ ga-eru iji gafe gawa n'aka onyeisiala Donald Trump. N'egwuregwu Ngalaba na-ahu maka egwuregwu bọọlu bụ Fifa achụọla otu onye Referee maka iri aka azụ. Ibrahim Chaibou bu onye Naịja agaghị emetutakwazi ihe metụtara egwuegwu bọọlụ aka na ndụ ya. Ọ ga-akwụkwa ihe karịrị pụku narị dọla abụọ. Akụkọ BBC Igbo na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47795373,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47795373,Arsenal: Ana m egosi ụwa na ndị Naịjirịa abụghị ndị ohi - Kelechi Arsenal,Kelechi Anyikude bụ nwaafọ Igbo ama ama na Lọndọn kwuru etu o si egosi ndị mbaụwa na ọ bụghị ndị Naịjirịa niile dị njọ.,"Ọ gwakara BBC Igbo etu o si malite ịza 'Kelechi Arsenal', ma bụrụ onye ndị mmadụ na-akwụsị ka ha sere foto. O kwukwara etu o si were ohere o nwere iji akwalite asụsụ na omenaala Igbo na mba ofesi. Ị ma na ọ gụrụ akwụkwọ rue ogogo Phd na ngalaba ""Engineering"" na-ahụ maka gburugburu ebe obibi? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50532731,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50532731,21 killed coal miners: Ndị hụrụ ka e si gbuo ndị ọrụ koolu n'Enugwu,Mazị Ogbonnaya Eze gbara afọ otu narị iri na otu(110) so na ndị ọrụ ahụ ndị ọcha kaara igbagbu n'ụbọchị ahụ mana Chi ya mụ anya.,"Mazi Aniagbo dị afọ iri asatọ na ise dị afọ iri na ise mgbe ahụ. Ha nọ n'ihu ụlọakwụkwọ ha mgbe ndị agha bịara njem ọjọọ ahụ bịara. Dịka o kwuru, ""ndị agha ahụ feere anyị aka ka anyị gbalaga"". Ha nọzị be ha na-anụ ụda egbe ahụ gbagburu ndị ọrụ mmadụ iri abụọ n'otu ahụ. Aniagbo mechara bido ọrụ dịka onye ọrụ koolu mgbe ọ gụchara akwụkwọ. Mgbe ahụ ka ọ nọ hụ ka e sị tie ezinụlọ ndị ya bụ ihe metutere aka n'obi. Kirie ha. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiemela Peter Mgbeahuru" 44883356,https://www.bbc.com/igbo/44883356,Gịnị mere e ji ezi ọha ndị a na-enyocha maka mpụ na Naịjirịa?,"Ka BBC jụrụ ihe kpatara e ji agba ndị a na-enyo enyo maka mpụ n'ihu ọha na Naịjirịa, otu ọkaiwu, Chijioke Ikeh, kwuru na enweghị iwu machiri ndị uweojii ịhapụ ka ndị ntaakụkọ gbaa ndị ahụ ajụjụọnụ.","Ọtụtụ oge ka ndị uweojii na-anwụchi ndị ha na-enyocha maka mpụ dịka izu ohi, igbu mmadụ, ịtọ mmadụ nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche. Mana ebe e nwere ike isi taa ha ụta ma ọ bụrụ na ị tunyere ha na mba ndị ọzọ, bụ ịkpọpụta ndị a na-enyocha maka mpụ ndị a n'ihu ọha, ka ọha 'kpee ha ikpe', site n'ịhapụ ndị ntaakụkọ ka a gbaa ha ajụjụ ọnụ. Ọkaiwu Chijioke Ikeh gwara BBC Igbo na ebe iwu nwere ike imegide ndị uweojii nke ndị mba ọzọ, iwu emegideghị ndị uweojii Naịjirịa maọbụ ndị ntaakụkọ ịgba ndị a na-enyo maka mpụ, ajụjụọnụ. O kwukwara na ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ agbaghị ha ajụjụọnụ, na agaghị ama ihe na-eme n'obodo. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Iwu egbochighị ndị uweojii ịgba ndị a na-enyo enyo n'anwụ N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu kwenyere na o nweghi ihe o mere ma ndị uweojii na-ahapụ ka ọha hụ ndị a na-enyocha. Amarizu kwuru na ọ na-egosi na ndị uweojii na-arụ ọrụ ha, ma kwuo na ọ ga-eme ka ndị mmadụ mara na e nwere ike ịkpọpụta ha ma gbaa ha n'anwụ ma ha mee ụdịrị ihe ahụ, nke ga-eme ka ha mụrụ akọ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a: Ịgba ndị a na-enyo enyo n'anwụ na-egosi na ndị uweojii na-arụ ọrụ - Amarizu N'aka ọzọ, Benjamin Amaechi bụ onye na-akwado ikike dịirị onye, gwara BBC Igbo sị ""ọtụtụ mgbe ndị uweojii na-akpụpụta ndị na-enweghị ihe ha mere."" Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Ndị uweojii na-akpụpụta ndị aka ha dị ọcha ma bo ha ebubo mpụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45155808,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45155808,Fidelity Bank: Ọ bụghị onyeisi ọrụ anyị tiri ndị mmadụ ihe,"Ihe nkiri na-efegharị n'intanet na- ekwu na onyeisi ọrụ Fidelity Bank n'otu ụlọọrụ ha nọ na Kola dị na Legos, nyere iwu ka ndị uweojii kụọ ndịahịa ha bịara iwere ego ihe n'ihi na ha kwara arịrị etu ihe si aga n'igwe ego dị n'ụlọakụ ahụ.","Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ndị uweojii nyere iwu ka ụmụnwoke abụọ nọrọ alal n'ala nkiti ma na-etikwa ha ihe na enweghị mgbochi ọbụla. Mana ụlọakụ ahụ agọọla na o nweghị eziokwu dị na ya bụ akụkọ. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ ahụ bụ Henry Ndiulo kwuru na o nweghị onyeọrụ ha nyere iwu ọbụla ka ka e tie ndịahịa ha ihe. ""O nweghị onyeisi ụlọakụ anyị sị ndị uweojii kụwa ndị mmadụ ihe."" Na nkọwa ya,mmadụ abụọ e gosiri n'ihe onyonyo ahụ na-enyo akara ndị bịara iwere ego n'igwe ego dị n'ụlọakụ ahụ, ndị ọrụ nchekwa ha nọ ọrụ gwara ha ka kwụsị, ha bidoroe luso ha ọgụ merụọ ya ahụ nke mere ka ndị uweojii a hụrụ n'ihe nkiri ahụ gboo ọgụ ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ulọakụ ahụ enyefela nmmadụ abụọ ha na-ebo ebubo n'aka ndị uweojii. Mana ndị mmadụ na-ekwu na Twitter n'ihe video kwuru na nke ụlọakụ ahụ kwuru dị iche. Ụfọdụ gosikwara iwe na ọsịsa Fidelity nyere ebubo ahụ. @Timotebz jụrụ maọbụ ihe kwesiri ka ndị nchekwa ụlọakụ ahụ tie onyeahịa ha ihe maka inyo akara mmadụ n'ogige ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49355339,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355339,Marriage Rites: Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ,"N'ala Igbo, omenala bụ na nwoke na nwaanyị agaghi ebi ma ya bụrụ na ha alụghị onwe ha.","Ọlụlu nke a na-akacha anabata bu nke omenala, mana ugbua ọtụtụ mmadu na-ewe nke Bekee ka nke ukwu. Maazi na oriaku Ogbonna bi dịka di na nwunye ruo afọ 40, mụchaa ụmụ, n'agbanyeghi na ha alụghị onwe ha. Ha gwara BBC Igbo ihe mere ha jiri gaa n'ihu mee ihe omenala kwuru. Lee ihe ha kwuru. Akụkọ ga-amasị gị: Ndị mere akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Chiemela Peters" egwuregwu-43468719,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43468719,"Mikel, Etebo na Ajayi agaghị eso sọọ mpi na Poland",Ozi na-erute anyị aka na-akọwa na onyeisi otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Mikel Obi na ndị ọzọ bụ Junior Ajayi na Oghenekaro Etebo agaghị eso sọọ mpi enyi na enyi dị n'etiti Naịjirịa na mba Poland.,"Mikel na agba bọọlụ na Tianjin Teda nke China Ozi ahụ si n'ọnụ NFF kwuru na Mikel agaghị eso maka na ọ nataghị ohere n'ụlọọrụ ya. ""Anyi na-eche na Mikel ga enweta akwụkwọ ya n'oge iji gawa Poland mana etu ọ dị ugbua, ọdịghị ka ihe a ga-eme. Ọ gaghị eso n'asọmpi a,"" onye na-ahazi ndị Super Eagles bụ Dayo Enebi kwuru. Nke Etebo bụ na ọ gaghị eso maka mmerụ ahụ o merụrụ mere na o soghị ndị otu ya bụ Las Palmas sọọ mpi ha na Deportivo La Coruna sọrọ na Satụdee. Ajayi n'onwe ya enwetaghị akwụkwọ iji si London gawa Poland mana ọ ga-eso sọọ mpi nke ha na Serbia. Ndị otu ha ndị ọzọ nọ na Poland ebidola nkwado asọmpi ha na Poland. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-45105598,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45105598,Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na bọọlụ,Ndị ntaakụkọ n'egwurgwu bọọlụ bụkwa ụmụnwaanyị ekwuola na Super Falcons nke Naịjirịa ka agbata ihe na bọọlụ karịa ndị ogbo ha ndị nwoke.,Ha kwuru n'agbanyeghi nke a na ndị mmadụ karịsịa ụmụnwoke a naghị etinye uche na bọọlụ ụmụnwaanyị na Najirịa nakwa Afrịka. Ha gara n'ihu kwuo na gọọmentị a naghị etinye uche nakwa ego n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka ha si eme na nke ụmụnwoke agbanyeghi na ụmụnwaanyị na-ebute Iko karịa ndị nwoke. Na ọ bụ ihe ndị a mere anaghị anụ akụkọ banyere asọmpi dị iche iche ụmụnwaanyị na-agba na Naịjrịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55818213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55818213,Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN',Onyeisi otu IYM bụ Eliot Ugochukwu Ukoh ekwuola na ọ bụ ndị Gọvanọ mere ka otu dị ka Eastern Security Network selite isi.,"O kwuru na ọ bụrụ na ndị Gọvanọ gere ntị na ndụmọdụ ya ịkpọkete ndị ntorobịa nso, ihe agaghị eru etu a. Cheta na onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ Eastern Security Network maka nchekwa mpaghara ala Igbo. Gee ihe Ukoh kwuru n'uju ebe a" egwuregwu-51343690,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51343690,Manchester United vs Wolves: Otu abụọ a bụ nnọọ ezigbo di na nwunye,Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United na Wolves dịzi ka ha abụ di na nwunye n'eziokwu.,"Ha abụọ eneyghị goolu ọbụla oge ha zutere n'ọgbọ egwuregwu 'Old Trafford' n'uhuruchi Satọdee. Ihe mere Man Utd na Wolves ji dị ka Ejima Bruno Fernandez Man Utd zụrụ oke ọnụ azọpụtaghị ha Ọ bụrụ na Tottenham emerie Manchester City ụbọchị ụka, ha ga-awufere ma Manchester United ma Wolves. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ'" afirika-45745415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45745415,Akụkọ dị mkpa: Onye na-eyi ndụ egwu ekwesiri ịzọ ọkwa ọchịchị?,"Akụkọ kachasị dị mkpa taa: Na mba ofesi,","Gọọmentị mba somalia egbochiela otu onye bubu onye ndụ ndị otu Al-Shabbab bụ Mukhtar Robow n'ịzọ ọkwa onyeisiala na ala ha. Ha kwuru na o nwebeghi ikike ị zọ ya bụ ọkwa n'agbanyeghị na ọ gọrọla isi ya n'otu Al-shabbab. Na Naịjirịa End of Twitter post, 1 Okwu pụtara na ntụlịaka ọkwa Gọvanọ emere n'Osun steeti ebirila ọkụ ugbua A na-anụ na ndị uweojii tụrụ anwụrụ anya mmiri na-ebe onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Saraki, Ben Bruce, Dino Melaye na ndị pdp ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe n'Abuja taa. Iwe ha bụ na emeghi ntụlịaka ahụ n'ụzọ kwụ ọtọ, ha boro INEC ebubo ịkwunyere otu APC na ntụlịaka ahụ. Mana dịka ọ dị ugbua, INEC agọọla ebubo ahụ na-ekwu na o nweghi onye ha na ya jikọrọ aka ịzu votu maọbụ oche gọvanọ n'osun steeti. N'Egwuregwu, Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu football na mba Briten adaala manager Newcastle bụ Rafael Benitez nha ego ruru puku pounds iri isii. Ha kwuru na ọ bụ maka na ọ dara iwu kwuru na ndị manager ekwesighi ịkwu uche ha gbasara onye ogbuopi tupu agbaa asọmpị ọbụla. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụtụtụ Uche Ogah ahọrọla Martin Azubuike ka Osote ya Uche Ogah na Martin Azubuike Onye ji ọkọrọtọ ndị APC maka ịzọ ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ Uche Oga akpọpụtala Martin Azubuike dịka onye osote ya na steeti ahụ. Azubuike bụbu onye omeiwu steeti ahụ si Isiala Ngwa so na ndị zọrọ inweta ikike ịnọchite APC. Mmadụ 25 ọzọ anwụọla na Plateau steeti Ọtụtụ mmadụ anwụọla na Plateau steeti kemgbe Jun 2018 A na-ekwu nke mere ọzọ emekwa: E gbuola mmadụ iri abụọ na ise (25) ọzọ na ọgbaaghara dị na Plateau steeti ụnyaahụ. Onye kwuputara nke a bụ Sunday Abdu bụ onyeisi ndị Irigwe Development Associaltion bụkwara onye nnọchite anya ndị ogbe ahụ na ụlọomeiwu steeti ahụ oge gara aga. US na Uk ebola Russia ebubo mpụ intanet Trump na Putin N'ofesi, mba Amerịka, Briten na Netherlands na-ebo Russia ebubo ime mpụ intanet a kpọrọ 'Cyber crime' na bekee. Ụlọọrụ ikpe nkwumọtọ dị n'aka na mba US ekwuola na Russia ji mpụ intanet enyopu ụlọọrụ na-enyocha ngwaagha kemikal nke mbaụwa nakwa nke mba Amerịka. N'egwuruegwu, Chelsea 1 - 0 MOL Vidi Chelsea na MOL Vidi N'egwuruegwu, na Europa league agbara ụnyahụ, Chelsea ji otu ọkpụ merie ndị MOL Vidi. Akụkọ ga-amasị gị: Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha" afirika-48665065,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48665065,Akụkọ Mere Ugbua: Ndị nkuzi Abịa alaghachila ọrụ,Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị nke Abia Steeti gbara abụbụọrụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa ga-alachi ọrụ.,Ndị nkuzi praịmarị sị ka akwụghị ha ụgwọ a kpọrọ 'Teacher Salary Subsidy' ebe ndị nke sekọndịrị na-achọ ụgwọ ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ. Otu onye ngalaba n'ahu maka ndi nkuzi na steeti ahụ achọghị ka ekwu aha ya gwara BBC Igbo na ha nọ nzukọ maka ọnọdụ a. Ekwentị Ode Akwụkwọ Mgbasaozi Abịa steeti bụ Onyebuchi Ememanka agaghị mgbe BBC Igbo kpọrọ ya. Akụkọ ka na-abịa. afirika-44234886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44234886,Enyimba meriri Tornadoes Unyaahụ N'asọmpị NPFL,Aha Emeka Obioma onye otu Enyimba FC na-ekpo ọkụ ukwuu ugbua makana ọ bụ onye nyere Enyimba aka i nweta mmeri n'asọmpị NPFL ha na ndị Niger Tonadoes gbara ụnyahụ n'ọgbọ egwuregwu nke Calaba.,"Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 Enyimba meriri Niger Tornadoes otu ọkpụ na asataghị ihe. Obioma nyere goolu nke nyere Enyimba mmeri a oge nkeji iri itoolu kụrụ kpọm. Mmeri a mere ka Enyimba rigo n'okwa asatọ na ndị kachasị agba n'ime NPFL ugbua. N'asọmpị Akwa United na Go Round FC, ọ bụ United bụ ndị nwe mmeri. Ha ji ọkpụ otu na asataghị ihe gbapụ Go Round FC n'ọgbọ egwuregwu nke Godswill Akpabio n'Uyo. Paul Obata bụ onye pụtara dịka dike n'asọmpị a, o nyere goolu a na nkeji iri anọ na ise. Akwa United rigo okwa nke isi maka mmeri a. Akukọ ndi ga-amasi gi:" 42711118,https://www.bbc.com/igbo/42711118,'Gbagharanụ arụ na-eme n'ụlọ ụka' - Pope Francis,Popu Francis kwuru na ya nwere ihere na obi mgbu maka ihe arụ a ndị ụkọchukwu na-emeso ụmụaka ma rịọ ka ndị ihe a metụtara gbaghara.,"Popu Francis ""Obi m na-agara ndị bishọp ụmụnne m, n'ihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka anyị rịọ mgbaghara ma kwado ndị ihe ọjọọ a metụtara"" Popu kwuru, ""Agbanyeghị na anyị na-agba mbọ ka ihe ọjọọ ghara imezi."" Popu kwuru ihe ndị a oge gwara ndị ozi mba Chile okwu na Santiago de Chile. Na mbido izu ụka a, Vatican weghara otu ụlọ-ụka Katọlik dị na Peru ebe e boro onye ụkọchukwu na ọ na-emetọ ụmụaka." afirika-43959663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959663,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ihe ọgwụ ike codeine na-eme ndị ntoroọbịa,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a,"Ọgwụ ụkwara codeine emela ọtụtụ ndị ntorobịa isi mgbaka Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Nigeria bụ Emzor achụọla otu onye oreeahịa ha ma kwụsị mmadụ abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara,codeine, n'ụzọ megidere iwu. BBC malitela ụbọchị Tuusde ngosi ihe onyonyo ha mepụtara nke na-egosi mkpamkpa iṅụbiga ọgwụ ụkwara codeine oke na-eme na ndụ ndị ntoroọbịa. A malitere ihe ngosi a na Sheraton Hotel Ikeja, Legos, ụnyaahụ dịka ozi na-ekwu na achụọla onyeisi azụmahịa ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical ndị aka na-arụ n'akụkọ ahụ. N'akụkọ ọzọ... Ndịọrụ chọrọ ụgwọọrụ opekatampe ọhụrụ Dika taa bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ bekee n'ala Naịjiria, onyeisi ndị Nigeria Labour Congress NLC bụ Ayuba Wabba, ekwuola na ha agaghị ekwe ka kọmitii ahụ ehibere maka ileba anya n'ụgwọọrụ opekatampe ndị ọrụ bekee dọghachị aka elekere azụ n'imejupụta nkwa ahụ. Wabba kwuru nke a n'emume ha kpokobara ndị ọrụ na Abuja ụnyaahụ. Na mba ndị ọzọ: Ndị United Kingdom akwadola amụma nke ndị Iran n'agbanyeghị na US na Isreal hụrụ aka enwe na ya bụ ofe. Israel mere ihe ngosi iji kwuo na Iran ji ụzọ aghụghọ etinye aka n'ịrụputa ogbunigwe nuklea nke ndị Iran na-agọ. Gee nkeji nke mgbede a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Codeine, ọtọmegbum" afirika-45202466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45202466,Anambra: Ụkọ mmanụ ebidola,Ụkọ mmanụ ụgbọala ebidola n ' Anambra,"Ndị bi n'Anambra steeti, ngalaba na-ahụ maka orire na ọzụzụ mmanu ụgbọala na steeti ahụ bụ Independent Petroluem Marketers Association of Nigeria agaala abụbụ ọrụ. Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ndị ha kuturu ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ha ego iti aka n'obi dịka ha si kwe ha nkwa. Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya, kwuru na ya bụ nsogbu metụtara ya na ndị be ya makana ha ahụghị mmanụ ụgboala ha ga-eji mụọ ọkụ Latrik. O kwuru na ha ga-aga n'Asaba gaa gbata mmanụ ụgbọala ha ga-eji mee ihe. CAN akpọọla ndị otu Kraịst ka ha bido ekpere Onyeisi ndị otu Christian Association of Nigeria (CAN) bụ Samson Ayokunle kwuru na ndị otu ha ga-eme ekpere ma burukwa ọnụ ụbọchị atọ maka ọgwụgwọ nsọ Naịjirịa. Ha ga-eme ekpere a n'ubọchị iri abụọ na asaa ruo ụbọchị iri abụọ na itoolu n'ime ọnwa Ọgọstụ. Mmiri eriela ụmụakwụkwọ 22 na onye nkuzi ha na Sudan N'Afrika, mba Sudan na-ekpe ekpere ka mkpuruobi ụmụakwụkwọ iri abụọ na abụọ na onyekuzi ha nwụrụ na mberede mere na-etiti osimiri Nile laa na ndokwa. Akụkọ kwuru na ha danyere na mmiri oge oke mmiri na-atụgharị ha n'osimiri ahụ. Victor Moses agaala ezumike nka Victor Moses ekwuola na ya agaala ezumike nka dịka onye ọgba bọọlụ Naịjirịa. Marakwa na ndị otu egwuregwu nta ụmụnwaanyị bụ Falconets na mba Spain ga-ezukọ echi n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị a na-agba ugbua. Gee nkeji nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị" afirika-45136339,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45136339,Akụkọ dị mkpa n'abalị a: A tọghapụla Lawal Daura ma kpachie akwụkwọ ikike njem ya,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Ndị ụlọọrụ nchekwa atọghapụla Lawal Daura bụbu onyeisi Ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'aha ịchafụ ma nara ya akwụkwọ ikike njem ya. Cheta na a chụrụ ya n'ọrụ ma nwụchie ya ụbọchị abụọ gara aga, maka izipu ndị ọrụ ya ka ha gaa wakpoo ụlọomeeiwu ma gbochie ndị ụlọomeiwu ịbanye n'ụlọọrụ ha. N' aka ọzọ, Matthew Seiyefa bụzị onyeisi ọhụrụ na DSS akwadola ịnọzịgharị ọnọdụ etu ụlọọrụ ahụ na-akpa ike nọ. O kwuru na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ngalaba ya lebara anya n'ebubo mmegide na mkpagbu e boro ụlọọrụ ha, ma kwuo na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-ejikọ aka igbo ọgụ nsogbu nchekwa n'ala Naijirai. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: 'Ihe ndị m ga-elebanye anya dịka onyeisi DSS ọhụrụ' EFCC wakpọrọ Ekpenyong onyebụbu onyeisi DSS Nke dị ka ibe ya bụ na ngalaba na-alụ ọgụ megide nrụrụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ wakporo ụlọ onyebụbu onyeisi ndị DSS bụ Ita Ekpenyong n'Abuja ma nyocha ya ihe karịrị awa abụọ. Dịka akwụkwọ akụkọ Punch siri kọwaa, nke a na-eme ka ọ gachara ọnwa iri DSS n'oge Lawal Daura dịika onyeisi gbochiri ha inyocha maọbụ nwụchie Ekpenyong na agbanyeghị mkpebi ụlọikpe nyere iwu ka ha mee otu ahụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa: Ndị obodo Nkwe na Ezere dị n'Enugwu steeti arịọla doo doo doo, biko biko biko, sị ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka maka akwammiri jikọrọ ha na ndị obodo ọzọ chọrọ ịda. Ha sị na ọ bụrụ na akwammiri a rụrụ n'afọ 1947 mgbe ndị si agha Burma lọtara daa, na ha enweghịzị ụzọ ọzọ ha ga-esi na-abata ma na-apụ obodo ha. Lee ya n'uju ebe a: Akwa a daa, mmekọrịta anyị na ụwa ga-ebi - Ndị Nkwe Mba Ofesi: Na mba ofesi, ihe na-ebute anya mmiri na mgbawa obi emeela na mba Yemen. Ihe ruru ụmụaka iri abụọ na itoolu anwụọla ebe iri atọ merụrụ ahụ ka ndị agha si Saudi tụrụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ha na mpaghara ugwu Saada. N'egwuregwu, Ndị otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa nta bụ Falconets ji otu ọkpụ merie Haiti ka ha abụọ zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị na-agafeghị afọ iri abụọ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ị hụla nwaanyị Igbo a na-eji ịnya ụgbọala akpa ego? Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego" afirika-45063198,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45063198,Inec: Anyị ga na-eke PVC rue ọnwa Feburuwarị 2019,Onyeisioche nke INEC n'Enugwu bụ Emeka Ononammadu ekwuola na ụlọọrụ ha ga na-eke kaadi e ji atụ vootu bụ PVC n'aha ịchafụ rue otu izuụka tupu a tụọ vootu n'afọ 2019.,"Ya bụ onye Resident Electoral Commissioner kwuru n'ụbọchị Ọgọstụ 17 afọ a ka ha ga-akwụsị idebanye aha n'akwụkwọ. Mana ndị debanyegoro aha ha nwere ike ịga na-ewere PVC rue Febụwarị afọ 2019. Ononammadu kwuputara nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'Enugwu. Ọ kọwara na ụlọọrụ ya na-agagharị n'okpuru ọchịchị 17 dị n'Enugwu iji kpokue ndị mmadụ ma nyochaa ka ha sị edenye aha n'akwụkwọ. Akụkọ pụtara na Inec ga-akwụsị inye kaadị PVC mana Inec akọwaala na ọ bụ idenya aha ka ha ga-akwụsi, na ọ bụghị ikesa kaadị PVC. Nke a pụtara na onye ọbụla edebenyeghị aha rue ụbọchị Ọgọstụ 17, agaghị edebanyelizi aha ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43283950,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43283950,Egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọku na Taraba,Nsogbu amalitela ọzọ na gburugburu Mambila plateau dị na Taraba Steeti nke mere ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na-egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Yelwa na Mesamari dị na Sardauna Local Government na Steeti a.,"Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue na Taraba maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi N'agbanyeghị na ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na-egburu ihe karịrị mmadụ 40 na mwakpo a ha sị bidoro n'abalị Satude, ndị uweojii na Steeti ahụ gwara BBC na ha amaghị mmadụ ole ihe metụtara. Ndị uweojii kwuburu na mmadụ ise nwụrụ na mwakpo nke e mere na Tụsde mgbe ndị Fulani na ndị Mambila nwere esemokwu. Mana mwakpo a mekwara n'abalị Satụde ma ruo Sọnde, butere ogbugbu ọtụtụ mmadụ. Ndị uweojii na-akọwa na ebe ihe a mere jụzịrị oyi ka ha zipụrụ ndị uweojii gburuguru ebe ihe a na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56600737,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56600737,Nnamdi Kanu: Ọ bụ ndị Fulani ka ESN na-ebuso agha na Na Nsukka,"Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob), ekwuola na ọ bụ ndị ọchịehi na-awakpo ala Igbo ka ndịọrụ nchekwa ""Eastern Security Network"" (ESN) na-awakpo na mpaghara Nsukka.","Kanu kwuru nke a dịka ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na-ekwu na ndị ESN na-ebuso ndị agha Naịjirịa agha na Nsukka. Na mgbasa ozi o mere n'akara soshal midia ya dị iche iche n'ụtụtụ Fraịde ka Mazi Nnamdi Kanu nọrọ kwuo okwu a. Ọ kọwara sị: ""Ọ bụ ndị wakporo ndị mmadụ n'Ebonyi steeti ka ESN busoro agha, chụrụ ha ọsọ gaa Nsukka."" ""Mana ndị agha Naịjirịa nọ na Nsukka ekweghị ka ndị ESN chụọ ndị ọchị ehi ahụ."" ""Ndị ekperima ka anyị na-achụ, ọ bụghị ndị agha Naịjirịa. Onweghị ihe anyị na ndị agha ji."" Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN' Na mgbasa ozi ahụ kwa ka Nnamdi kanu nọrọ kpọpụta aha ndị ga na-achịkọta otu IPOB na mba United Kingdom. Aha ha bụ Mercy Slatter na di ya bụ Mike Slatter. Cheta na onye bụbu onyeisi IPOB na UK bụ Mazu Uche Mefor, onye bụkwa osote onyeisi IPOB n'ụwa niile. Mana Uche Mefor na Nnamdi Kanu agbasaala, nke mere ka Mefor kwara pụọ na IPOB ma sonyere otu a kpọrọ 'Biafra de facto Customary Government' Asari ejighi aka ya mee onwe ya onye isi oche Defacto Biafra Government - Uche Mefor Nnamdị Kanu sị na ya hibere atụmatu ESN maka ịkwụsị mwakpo o sị na a na-awakpo ndị mmadụ n'ime ọhịa n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na otu Ipob bụ ""otu na-eyi ọha egwu"" mana Ipob na-ekwu na nke ahụ abụghị eziokwu." afirika-44653207,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44653207,Ipob: Ị hụla ndị tụrụ ogbunigwe be Nnia Nwodo,Aka ndị uwe ojii n'Enugwu akparala otu nwoke achụrụ achụ n'ọrụ uwe ojii bụ Ekene Okechukwu na onye otu ya bụ Amah Gabriel ndị ha kwuru na ọbụ ha tụrụ ogbunigwe n'ulọ Nnia Nwodo onyeisi Ohaneze Ndigbo na April 29 afọa.,"Ndị uweojii sị na ndị a ha nwụchịri ndị omokome ndị ọzọ n'Enugwu Gabriel gọrọ sị na ya abụghị onye ohi, na nani ihe ya mere bụ izịgara chief Nnia Nwodo ozi na-ekwentị ya kwa mgbe kwa mgbe na abara ya mba ka ọhapụ ụmụ Ipob aka. Commishiọna uweojii n'Enugwu bụ Dan-mallam mohammed onye gosipụtara ndị ahụ n'ihu ndị ntaakụkọ kwuru na ha ga-ekpochapụ ndị ji egbe aga ohị nakwa ndị omekaome dị icheichen'Enugwu. Amah sị: ""A na m arịọ mgbaghara n'ihi na amaghịm onye Nwodo bụ, ọ bụ n'igwe okwu nke Biafra ka m nụrụ akara ekwentị ya were zipụ ozi ahụ."" Nwodo na onye uweojii Cheta na atụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo n'obodo Ukehe n'Enugwu n'ọnwa eprel. Ndị IPOB gọrọ n'aka ha dị n'okwu ahụ. Ndị otu ndị aka ji ndị uweojii kpọpụtara igosi ndị ntaakụkọ dị ise Otu Ndị ohi ha jidere dị ụzọ ise. Na aka ọzọ ndị uweojii gosikwara otu nwoke bụ DSP n'prison ya ndi otu ya na ekweghị ndị Enugwu ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ya bụ Dsp aha ya bụ Collins Ugwu bụ onye ejidere ebe ha na-ezu ohi ma napụtakwa ha ụgbọala ha zuru ezu. Ya bụ onye ọrụ prisons na ndị otu ya na esoro ndị sị na bank puta, laa n'ụlọ ha gaa were egbe nara ha yabụ ego, ma gbagbue onye ahụ ọtụtụ mgbe. Onye isi aba-okpu ọzọ ejidere bụ michael Anthony onye Aninri, nke tachịrị obi tọrọ nwata akwụkwọ Ifeyinwa Ugwu na 13th May 2018, machaa ya elu n'ike ma gbuo ya, lịkwaa ya na obere ili. Onye ohi ọzọ bụ ndị jị keke napep ebu ngwongwo ndị mmadụ bụ Amoke matheu na Solomon Nwankwo ndị sị Abakalịkị. Ejidere ha ebe ha bụ Armored cable ha zuru n'ohi were na aga ebe ha ga ere ya. Ohi Armoured cable bụ nke na ewu ewu n'Enugwu ugbua nke na ha na-aga na ọtụtụ ụlọ nta akụkọ n'Enugwu ga bechasịa ya bụ ụdọ ejị agbasa ozi. Otu nwatakịrị dị afọ iri na isii aha ya bu Nzubechukwu, ka ejidere dịka onye na edobere ndị otu ya egbe, igwe computer, ekwe ntị, ego nakwa otụtụ ihe ha zuru ezu. Commissioner Dan-Malam kwere nkwa na ndị ajọ mmadụ enweghị ebe ezumike n'Enugwu steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48447717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48447717,Ipob sit home: N'Ọnịcha na Nnewi ihe Igbo kpụ n'ọnụ bụ Mee 30,"Dika ọ fọrọ naanị otu abalị ka a banye Mee 30, bụ ụbọchị ncheta afọ iri ise na otu a lụrụ Agha Biafra, okwu a kpụ n'ọnụ na mpaghara ụfọdu n'ala Igbo - ọkachasị n'Ọnịcha na Nnewi - bụ ịnọ n'ụlọ dịka otu Indegenious People of Biafra (Ipob) kpọrọ ndị otu ha na Ndigbo nile.","Onye ntaakụkọ BBC Igbo onye kpagharịrị n'obodo abụọ ndị a ụbọchị Mee 29 hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ahia nakwa ọdọ ụgbọala na-ekwu maka ya bu oku Ipob kpọrọ. Onye ntakụkọ anyị hụkwara akwụkwọ mgbasaozi nke n'agbasa ozi n'akpo oku ka onye ọ bụla nọrọ be ya n'ebe dị icheiche na Nnewi. Ndị e chere na ha bụ ndị otu Ipob bụ ndị yicha ihe na-eyi egwu dapụtara n'ụfọdọ akụkụ kpagharịa ma minakwaa. Otu onye achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC na ya na ndị enyị ya na ndị ya na ya na-azụkọ ahịa agaghị apụta. ""Echi ga-adị kpọ kpọ. Ndị mmadụ na-ekwu na ha agaghị apụta echi."" N'Ọnicha, onye ntaakụkọ anyị hụrụ ọtụtụ ndịagha bu ụgbọala ha na-akpagharị ka ha jupụtara. Ndị uweojii nọkwa n'ebe ụfọdụ ọtụmadị na ""Headbridge"" Onicha. Ewepu ndịagha na ndị uweojii, obodo dere jụụ n'Ọnịcha dịka ọtụtụ ndị bi Onicha, ndịọrụ na ndị ahịa na-aga mkpa ha na-enweghị nsogbụ ọbụla. Cheta n'izu ole na ole gara aga, otu Ipob kpọrọ ndị otu ha oku ka ha nọrọ n'ụlọ iji gosi iwe maka ndị e chere na ndị Fulani na-achị ehi gburula. Akwa mmiri Niger tọgbọ chakoo n'agbanyeghị na ọ bụ ebe ụgbọala na-ejukarị na-ebute ịga nwayọ nwayọ na 'site at home' nke 2018" afirika-56103862,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56103862,"Duke of Edinburgh Prince Phillip: ""Ọ na-agbake nwayọ nwayọ"" - Ọbieze Buckingham","Ụlọeze ndị Buckingham ekwuola na Duke ndị Edinburgh ""na-agbake nwayọnwayọ ma na ahụ adịwala ya mma"" dịka a na-agwọ ya maka ọrịa o butere mana atụghị anya na ọ ga-apụta n'ụlọọgwụ ruo abalị asaa.","Cheta na e nyere Ọkparaeze Edinburg akwaoria n'ụlọọgwụ n'abalị Tuzde, otu ụzọ iji kee nkwụcha maka oyii mekpara ya ahụ, dịka odeeakwụkwọ ndị obieze obodo Buckingham si kwuo. A gwara ndị BBC na e dugara Prince Philip gbara afo iri itoolu n'itoolu n'ụlọgwọ (afọ 99) King Edward nke asaa bụ otu ụzọ ịkpachapụrụ ya anya dịka onye dọkịnta si nye ntuziaka. Akụkọ banyere onye Eze, onye ji ezi obi merubere ncheta ọmụmụ afọ otu narị ya na abalị iri nke ọnwa Juun, no n'ụlọ ọgwụ ebe atụwara anya na ọ ga anọ mkpụrụ abalị ole na ole ka elebere anya ma mee ka o nwetu ezumike. Duke of Edinburgh Prince Phillip: Di Ezenwaanyị Elizabeth nọ n'ụlọọgwụ Ugoeze onye gbara afo iri itoolu na ano ka no na obodo Windsor." egwuregwu-49805234,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49805234,Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa egwuregwu,"Ndị na-agba chaa chaa na-asị na 'e tinye okwe e rie okwe, onye ụjọ ababa' mana ha amaghị ọghọm dị na ya.",Nyocha BBC mere na mba Yuganda gosiri na ego ndị na-agba chaa chaa na-etinye na-akarị nke ha na-erite. Nke mere gọọmentị mba ahụ na-achọ ụzọ ha ga-eji ebelata ụmụokoroọbịa ị na-agba chaa chaa. Kirie ka ị hụ mpụtara dị n'ime nyocha a. Akụkọ ga-amasị gị afirika-46808827,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46808827,ASUU strike: Ihe mere ụmụakwụkwọ mahadum anaghị agụcha n'oge,Olamide Tejuoso eteela o lewere anya mmalite 2019.,"Ọ tụrụ anya na ọ ga-agụcha akwụkwọ, bido ịmụ ọrụ ebe a ga-akwụ ya ụgwo n'ụlọọrụ mgbasaozi. Nke a bụ ụzọ nke mbụ n'ịhụ na o mepụtara ebumnobi ya ịbụ onye ode akwụkwọ ka ọ gụchara afọ anọ na mahadum nke Ibadan. Mana kama aṅụrị, nwata akwụkwọ a na-amụ maka ọrụ mgbasa ozi nwere obi nkụda maka abụbọ ọrụ ndị Asuu na-eme. Ụmụakwụkwọ na mahadum gọọmentị steeti ebidobeghị akwụkwọ n'ihi abụbọ ọrụ ebighi ebi ndị nkuzi bidoro. Ngalaba na-elekọta ndị nkuzi mahadum ebola gọọmentị ebubo na ha adaala mba na nkwenye ha na ha nwere gbasara mgbanwe agụmakwụkwọ mahadum. Ha gbara abụbọ ọrụ maka enweghị akụrụngwa, ụkọ ego na kepu kepu ha na-anụ maka iweli ego ụgwọ akwụkwọ. Ndị Asuu na gọọmentị etiti nwere nzukọ ụbọchị Mọnde ebe mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru na pati abụọ ahụ ekwekọritala. Gọọmentị kwere nkwa ịtọhapụ ijeri naira iri na ise (15.4bn) n'ọma maka nhazi mahadum nke ọha. O kwukwara na onyeisiala Muhammadu Buhari akwadola ijeri naira iri abụọ a ga-akwu ndị nkuzi mahadum n'ugwọ e ji ha bido n'afọ 2009 ruo 2012. Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ha ka ga-ekwekọrịta n'etiti ha maka ikwụsị igba abụbọ ọrụ, nke tinyere ndị mahadum gọọmenti ruru otu nde n'ọma na gbagharịa. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Mana nwata akwụkwọ Tejuoso kwuru na dika onye nọ n'agba ikpeazụ na Mahadum, na obi na-agbawa ya n'ihi na ihe niile ọ haziri ime enweghị nke na-abịa na mmezu ugbua. N'okwu ya, ""Ekwesiri m ịpụta na mahadum n'ọnwa Disemba 2018 mana maka abụbọ ọrụ a, o nweghị ihe nwereike ime."" ""Anyị nọ n'ụjọ makana anyị amaghị mgbe ihe a ga-ebi"". Onye sokwa bụrụ onyeisi ndị ọrụ a kpọrọ Ọkammụta Ogunyemi kwuru na abụbọ ọrụ a bụ maka ichekwa ọdịnihu mahadum nakwa nke ụmụakwụkwọ. Otu ihe ndị otu ọrụ a na-arịọ bụ ka gọọmentị etiti mezuo nkwa ha kwere na mbụ ma nye ha ego ruru otu tarị naịra iji ghazigharịa mahadum dị icheiche. Etu ọ dị ugbua, gọọmentị etiti na-ewepụta ego ruru Ijeri nari naira isii maka ngalaba agụmakwụkwọ. Mahadum nke gọọmentị etiti na-eketa Ijeri narị naịra abụọ n'ọma n'ime ego e kepụtara maka bọjeti 2018. Ihe a ga-eme ya abụbọ ọrụ nke abụọ kamgbe onyeisiala Buhari banyechara ọchịchị n'afọ 2015. Asuu na-agbakarị abụbọ ọrụ kamgbe Naijirịa banyere ọchịchị onyekwuo uche ya. N'agbanyeghị nsogbu abụbọ ọrụ a buterela, ndị dịka Lydia Agu Uka, o kwenyere n'ihe kpatara e ji malite abụbọ ọrụ a. Ọ bụzi Asuu ka a na-eche ka ha kweta n'ihe gọọmenti kpebiri ma kwụsị abụbọ ọrụ a. Ka ndị dịka Tejuosho na Agu Uka na-ekwu na ha nwere olileanya n'okwu a ga-enwe isi, e kwere nkwa na ọ bụrụ na a kpachaghị anya, na abụbọ ọrụ ga-abụ ihe a ga na-ahụ n'ime agụmaakwụkwọ Naịjirịa. Akụkụ ndị ga-amasị gị:" afirika-45807483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45807483,Lagos Airport: Ndị njem tọrọ na MM2 ka ndi ọrụ na-eme ngagharị iwe,Ụkwụ tọrọ ọtụtụ ndị njem ụgbọelu n'ụzọ dịka ndị otu ndịọrụ ụgbọelu dị ise kpochiri ọdọụgbọelu Muritala Muhammed nke abụọ (MM2) n'ụbọchị Wenezde iji gosi iwe maka ndị otu ha mmadụ 20 a chụrụ n'ọrụ.,"Lagos Airport: Ndị ọrụ ọdọụgbọelu na-eme ngaghariwe Ụlọọrụ Bi-Courtney Aviation Services Limited (BASL), ndị na-achịkọta ọdọụgbọelu MM2 chụrụ ndị ahụ n'ọrụ na mbido afọ 2018. Ndị otu ndịọrụ na-akpa ike ahụ gụnyere; otu National Union of Air Transport Employees (NUATE) ; Air Transport Services Senior Staff Association of Nigeria (ATSSSAN), nakwa 'National Association of Aircraft Pilots and Engineers (NAAPE).' Ndị njem tọrọ na ọdọụgbọelu Muritala Muhammed nke abụọ (MM2) dịka ndị otu ọrụ ụgbọelu kpọchiri ebe niile Ha egeghị n'iwu ụlọikpe nyere nụbọchị Tuuzde ka ha ghara igbosa ka o si aga n'ọdọụgbọelu ahụ dịka ụlọọrụ Bi-Courtney gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe. Otu onye na-arụ n'ọdọụgbọelu gwara BBC Igbo na ""otu jịkọrọ ndị ọrụ na-eme nghariiweagba abụbọ ọrụ."" Ọnụ na-ekwuru otu ndị ọrụ ahụ ngalaba nke Legọs bụ Anthony Ijeh gwara BBC na 'ihe mere bụ na ndị ụlọ Bi-Cortney achọghị ka ndị ọrụ ha bụrụ ndị otu anyị."" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52241495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52241495,Coronavirus tips: Lee nkọwa puruiche maka ọrịa a,Ndị mmadụ nwere ọtụtụ ajụjụ ha na-ajụ gbasara ọrịa.,Bịa mata ọsịsa gbasara ajụjụ ndị gbagọjuru gị anya maka ọrịa Coronavirus. Ndị mepụtara akụkọ a bụ Chioma Nkemdilim na Vining Ogu. afirika-46589867,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46589867,"Charly Boy: Nnamdi Kanu ekwuteghi ya, Naịjirịa abụghị 'zoo'",Charly Boy bụ onye ama ama maka ịchọ ka ndị ọha Naịjirịa nwete ezigbote ọchịchị.,"Ka a na-ahazi ntuliaka nke 2019, ọ gwara BBC na ndi ntoroọbịa adịghị eme ihe ha kwesiri ịme. Ọ sị na ha na-arapụ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-aghọgbụ ha. Na nkọwa ya, Charly Boy sị na ọ bụ ndị ntoroọbịa bu gọọmentị. Gee ya nti n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47267889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47267889,Canada Immigration: Ị chọrọ 'ịgbaga' mba a?,Mba Kanada ekwuola na ha na-atụ anya ịnabata ihe ruru mmadụ otu nde na puku narị abụọ n'ime afọ atọ na-abịa.,"Nke a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Naịjiria na-achọ ma ohere ọ ga-adịrị ha. Nke a abụghị mbụ ndị Naịjiria na-achọkwa etu ha si agafe mba Kanada. Mgbe e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị 2019, ụfọdụ ndị mmadụ malitekwara ịchọ ụzọ ha si agbaga Kanada. O wuru ewu na soshal midia nke ọma, mere ka BBC wepụta ihe na-egosi etu ị ga-esinwu gaa (ma ike dịkwa gị o). Ya bụ na ị chọrọ isi Naịjria pụọ, Oge ole ka ọ ga-ewe gị? Ịga ije Iji ụgbọala Ife n'ụgbọelu" afirika-45048686,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45048686,Mmegbu na mkpagbu dị n'ụlọ ọgwụgwọ ọrịa ndị Sọmalị,"Ndị ntaakụkọ nzuzo BBC Africa gara n'ogbe ndị Sọmalị dị na Nairobi, Kenya mee nchọpụta.","Nyochapụta anyị a na-egosi mmegbu n'ụlọ nleta Darushifa bụ ụlọ a na-agwọ ndị na-aṅụ ọgwụ ike na ndị isi mgbaka. Anyị chọpụtara na a na-ejichie ndị mmadụ n'ike, na-eti ha oke ihe ma na-enyekwa ha ọgwụ mkpọrọọgwụ na-eme ka ha gbọọ oke agbọọ." afirika-45955906,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45955906,Nnamdi Kanu ka bụ onyeisi IPOB - Emmanuel Kanu,Akụkọ ga-amasị gị:,Emmanuel Kanu gwara BBC Igbo na ozi ahụ pụtara na soshal midia kwuru na akwatuola Nnamdi Kanu dika onye isi IPOB bụ asi ọcha. afirika-52081650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52081650,Coronavirus: Mgbachi ụlọ uka ga-emechi ụzọ ngozi na amara - Archbishop Chukwuma,Onyeisi ụka Anglịkan n'Enugwu bụ Archbishop Emmanuel Chukwuma kowara uche ya banyere nkwụsi ụka maka ihi ọrịa coronavirus.,"Chukwuma si na ya agaghị agbachị ụlọụka kama ihe ya ga-akwado bụ ka ebelata ndị na-abịa ụka otu mgbe. Ọ sị na ọ bụ Chukwu nwe ụka, nke pụtara na imechi bụ imechi ụzọ ngozi na amara. Ọ bu ya na Ebere Ekeopara nwere mkparịtaụka a. Mana Bishọp chịburu Dayọsis Mbaise dị n'Imo steeti kwuru na ya kwadoro atụmatụ gọọmentị ịkwụsịtụ ndị mmadụ ịgbakọ n'ụlọụka. Bisho BJE Ogu kwuru na ụka kwesịrị inyere gọọmentị aka na mbọ ha na-agba iji chụlaa coronavirus. Gee ihe o kwuru:" afirika-47871376,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47871376,Nigeria Killings: Nlaghachị Buhari ọ ga-akwụsị oke ogbugbu na Naịjiria?,Ndụ mmadụ adịghị abụọ ya mere okaiwu Goddy Uwazuruike ji kwuo na obi ya na-agwa ya na onyeisiala Buhari nwereike ịkwụsị oke ogbugbu na-eme n'ụfọdụ ebe na Naịjiria.,Uwazuruike kwuru na onyeisiala chọrọ ime dịka onyeisiala ọ bụ na ọ ga-akwụsịnwụ oke ogbugbu ndị a. Ọ na-arịọ ka onyeisiala kwụba aka ya ọtọ ma mee ka ụwa mara ihe o na-eme gbasara oke ogbugbu na-eme n'akụkụ dị iche iche ugbua na Naịjirịa. Ifeanyi Olumba bụkwa oye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na onyeisiala ọ bụla batara ọchịchị kwesiri i bu nchekwa n'obi dịka mkpa ọ ga-ebu ụzọ gbro ndị ọ na-achị. Olumba kwuru na onyeisiala ọ bụla na-emelighị nke a adaala nakwa nke a ga-eme ka ndị oji ego achụ ego gbalaga. Anyị gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị lọọrụ onyeisiala mana onye dịka Femi Adesina bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ya ebughị ekwenti ya. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-54034561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54034561,DSS na Ipob: Anyị achọghị iji maka Biafra na-akwafu ọbara - Igwe Emene,"Igwe Felix Ugwu, bụ eze odịnmala nke obodo Emene dị n'Enugwu steetị gwara BBC ihe ọ ma maka ọgbaghara dara n'etiti ndị DSS na ndị Ipob nke butere ogbugbu mmadụ.","Igwe Ugwu kwuru na ọ nweghị onye Emene so na ndị e gburu na nsogbu ahụ. Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ eso ihe nwere onwe maka ọ bụ ihe ejibu kwafuo ọtụtụ ọbala na gboo. Ọ sị: ""Ya bụrụ na ọ bụ uche Chukwu, anyị ga enweta nkewa Naịjirịa. Ya bụrụ na Chuwku ekweghị, anyị ka ga-anọkwa ebe anyi nọ."" Gee ihe o kwuru n'uju:" afirika-44435388,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44435388,Amabeghị ezinaụlo ndị nwụrụ na mberede mere n'ụzọ Onicha - Uweojii,"Ndi uweojii ekwuola na ma maka mmadụ asatọ, asaa n'ime ha echere na ha bụ ndi otu ezinaụlọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'Ugwuonyeama nke ụzọ Enugwu-Onicha. Mmadụ anọ merụrụ ahụ mgbe ihe mere n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun nke afọ a.","Onwebeghị onye si na ọ mara ndị anwụrụ anwụ Ihe mberede a mere n'elekere iri na otu nke ụtụtụ gburu ndị niile n'eme njem n'ime obele ụgbọla dịka otu ụgbọala bu ndị njem ọzọ sọbara isi n'ụgbọala nke ha. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu n'ekwentị, o kwuru na nke a bụ ihe mere eme. Amaraizu kwuru na amatabeghị ndị nwee ma ọ bụ ndị ụmụnne ezinaụlọ mmadụ asaa ndị a nwụrụ anwụ. Ndị mmadu nakwa ede maka ihe a mere na soshal midia. O kwuru na onweghị onye kwurula na ndị a bụ ụmụnne ha, kama na nyocha ka na-aga n'ihu ị mata etu ihe a jiri mee. Gere ihe Amaraizu kwuru n'elu; Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50368534,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50368534,NYSC Camp: 'Nwaanyị achọghị iyi 'trouser' ya kwara laa' - General Shuaibu Ibrahim,Iwu 'National Youth Service Corps' gbasara ụdị uwe ndị niile na-efe ala nna ha ga na-eyi agaghị agbanwe bụ ihe Ọchịagha Shuaibu Ibrahim bụ onyeisi ngalaba na-azụ ndị ji otu afọ efe ala Naịjirịa bụ NYSC kwuru maka mmadụ abụọ achụrụ n'Ebonyi.,"Ndị otu NYSC Ihe e ji chụlaa ụmụagbọghọ abụọ ahụ bụ na ha jụrụ iyi uwe ụkwụ ogologo (trouser) a chinyere ha. Ha kwuru na okwukwe ha dịka ndị ụka Kraịst megidere nwanyị iyi uwe ụkwụ ogologo. Ibrahim gwara BBC n'ụbọchị ụka na ọ bụ eziokwu na-achụrụ ha. Shuaibu Ibrahim, onyeisi ngalaba NYSC Ọ sị na iwu NYSC kwuru hoo haa na onye ọbụla nọ n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha ga-eyi uwe e nyere ya. ""Agbanyeghị ofufe onye, mmadụ niile ga-eyirịrị ihe iwu kwuru."" Iwu NYSC (section 3[8]) kwuru na onye ọbụla dara iwu ahụ ga-aga n'ihu ụlọikpe dị n'ime ogige ahụ. Ọ bụrụ na ikpe mara ya, a ga-achụla ya. Ibrahim kwukwara na ụmụnwanyị nwere ike mee 'trouser' ha ka o buo ibu, ka ọ ghara igosi akụkụ ahụ ha niile. Mana ha enweghị ikike ọbụla ịgbanwe ya ka ọ ghọọ uwe ukwu ụmụnwaanyị a kpọrọ 'skirt'. Mgbe BBC jụrụ Ibrahim gbasara ndị ụka Alakụba na-eyi hijab, o kwuru na nke ahụ agaghị egbochi ha ịsọ ga njem n'ahịrị bụ nke Bekee kpọrọ 'marching'. Ibrahim kọwara sị: ""Ọ bụnadị n'ogige ndịagha Naịjirịa, a naghị eyi 'skirt' eme 'marching'."" Ọ kọwakwara na egwuregwu ndị ọzọ a na-eme n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha, abụghị nke e ji 'skirt' eme. Etu ịkwesịghị isi yie uwe NYSC Akwa iwu kwadoro maka ndị NYSC Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Nwa ebu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi'" afirika-49548967,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49548967,"Hurricane Dorian: Oke ifufe eburula ụlọ 13,000 na Bahamas",Akụkọ dị mkpa: Bahamas nọ na nsogbu,"Foto si soshal midia na-egosi Marsh Harbour dị n'Abaco Islands Oke ifufe a kpọrọ Hurricane Dorian, ebutela oke idemmiri na mba Bahamas. Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi mmadụ ole o gburula maọbụ merụọ ahụ, mana ndị ọrụ gbatagbata Red Cross na-ekwu na ọ dị ka ọ metụtara ụlọ ruru puku iri na atọ. Mara na ndị mmadụ bụ ndị mba ahụ dị puku narị atọ na iri itoolu na otu (391,000). Nke ka nke bụkwa na oke ifufe a echewela ihu na mba Amerịka, ebe ndị obodo dịka Flọrịda, Giọgia, Nọt na Saụt Karolaịna, nọzị n'ọnọdụ 'gbata ọsọ bịa nyere anyị aka"". Gọomentị etiti etinyela ọnụ na mwakpo ndị Naịjirịa Geoffery Onyeama bụ minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba, ekwuola na gọọmentị Naịjirịa ga-ama ihe ha mere maka mwakpo ndị Naịjirịa na mba Saụt Afrịka. Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mba ahụ zuru ohi ma gbaa ụlọahịa ụfọdụ ndị Naịjirịa na ndị mba ọzọ nwe, ọkụ. Ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu Gọọmentị etiti mechiri ọdọụgbọelu a n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst, 2019, maka ịrụ ọrụ n'okporoụzọ ebe ụgbọelu na-agba dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ bụ Henrietta Yakubu si kwuo. Ọrụ amalitebeghi n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti, n'agbanyeghi na ọ bụ maka ịrụ ya ọrụ ka gọọmentị ji mechie ya. Gụọ maka ọnọdụ ọ nọ ugbua, ebe a: Lee ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti Mmechi ahịa ọzụzụ na orire na Yurop Dịka ahịa ọzụzụ na orire nke Serie A, La Liga, Bundesliga nakwa Ligue 1 na-emechi taa, ụfọdụ ka na-eche ịma ebe ndị bọọlụ na-amasị ha ga-agafe. Ka ọ dị ugbua, Henrikh Mkhitaryan nke Arsenal agafeela Roma dị n'Italy na mbite. O nweghi ihe ọjọọ dị n'ịzụrụ anyị ụgbọala n'ụzọ iwu kwadoro - Ndị Sinetọ Otu dị iche iche gụnyere SERAP, BudgIT na Enough is Enough akpụpụla ndị Sineti n'ụlọikpe maka ego dị ijeri naịra ise na ụma ha chọrọ iji azụrụ onwe ha ụgbọala. Ha kwuru na nke a megidere iyi ndị ụlọomeiwu ṅụrụ ime ka ndụ dịrị ụmụ Naịjirịa mfe dịka ha a-ewere ọkwa ọchịchị Mana ọnụ na-ekwuru ndị Sineti bụ Sinetọ Dayo Adeyeye sị na ntị ya anụbeghi ihe ọbụla banyere ịjị ụdị ego ahụ azụ ụgbọala. N'ajụjụ ndị ntaakụkọ Channels TV jụrụ ya, Adeyeye kwuru na ọ bụrụ na amapụtara ego ahụ na mkpata na mmefu, na onweghi ihe ọjọọ dị na ya. Ọdọ ụgbọelu Asaba ga-abụ nke ụwa niile: Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na ọdọ ụgbọelu dị n'Asaba, Delta Steeti adịla njikere ịbụ nke e ji efega mbaụwa niile. Sirika gwara ndị ntaakụkọ nke a ụnyaahụ dịka o na enyocha ngwaọrụ ọhụrụ dị iche iche dị n'ọdọ ụgbọelu ahụ. N'ofesi Nwafọ mba Amerịka a ma ama n'ịkpaọchị bụ Kelvin Hart na mmadụ abụọ ndị ọzọ nwere ihe mberede okporoụzọ n'isi ụtụtụ Sọnde. Agbanyeghi na onweghi onye nwụrụ n'ime ha Kelvin Hart na otu onye ọzọ nwere ezigbo mmerụ ahụ n'azụ ha. N'egwuregwu Onye bụ ọkaibe n'ịkụ Tennis bụ Novak Djokovic ewezugala onwe ya n'ịkụ Tennis US Open nke ya na Stan Wawrinka n'ihi mmerụ ahụ. Djokovic nwetere mmerụ ahụ n'ubu ya n'ime nkeji ole na ole ha malitere asọmpi ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49798242,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49798242,Uche Ntoroọbịa: Kedụ mgbe ị ga-eme nsusu ọnụ?,Ụmụ ntoroọbịa na-me enyi ebe niile n'ụwa a.,Otu ihe ụfọdụ n'ime ha na-ajụ bụ kedụ mgbe ọ ga-abụ ha ga-esusu ọnụ. Ụmụ ntoroọbịa ndi ọzọ tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Akụkọ ga-amasị gị 43807314,https://www.bbc.com/igbo/43807314,Bill Gate ewepụtala ijeri dọla anọ maka ịchụ ịba,"Onye ọrụ ebere ma bụrụkwa onye nwe Microsoft bụ Bill Gates, gwara BBC na ya na ndị nnyemaka ndị ọzọ ga-eji ihe ruru ijeri dọla anọ ($4bn) kwado mbọ a na-agba iji belata ruo ọkara ọnwụ a na-anwụ site n'ọrịa ịba.","Bill Gates so n'ọgaranya kachasị n'ụwa Ọ sị na ego ya ahụ ga-abụ maka inye ụlọmgbochi anwụnta nke a kpọrọ bednet na bekee nke a na-eji agbalahụ mgbasa ọrịa ịba ya na ikewapụta ebe ha dị. Ebumnobi ọzọ bụ iji chọta ọgwụmgbochi tọrọ atọ. Gates kwuru nke a oge ya na ndị na-ebu agha megide ịba na otu nkwado ahụike mere ọgbakọ banyere ịba na Lọndọn. Ngalaba mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ WHO n'aha ịchafụ kwuru na ndị ọrịa ịba metụtara gbalitere rue nde ise site n'afọ 2015 rue 2016. Dịka WHO siri kwuo, ndị ọ kacha metụ bụ ụmụaka. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49765528,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49765528,Port Harcourt Killings: Ndị uweojii akpụpụtala onye ha ji maka ogbugbu ụmụnwaanyị,Ndị uweojii na Rivas steeti akpọpụtala otu nwoke dịka onye ha na-ebo ebubo ogbugbu ụmụnwaanyị n'ụlọ ndina na steeti ahụ.,"Akpụpụtala nwoke a n'ihu ndị ntaakụkọ n'ụtụtụ a. Etu ogbugbu ụmụnwaanyị a dị iche iche siri yie ibe ya mere ọtụtụ mmadụ jiri na-asị na onwereike bụrụ atumatu Bekee kpọrọ ""serial killing"". Etu ndị uweojii siri gbaa nwoke a n'anwụ mere ka ụfọdụ mmadụ na-ajụ na soshal midia ma amara ya ikpe tupu akpụpụ ya ụlọikpe." afirika-50002728,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002728,World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma',Nwaada rịaburu ọrịa obi ịdamba kọwara ihe butere ọrịa a nakwa ihe ndị ọ hụrụ n'ime ọnọdụ a obi ịdamba.,O kwuru na ọ nweghi ike ịkọwa ihe kpatara obi ji na-ada ya mba ma ọ bụrụ na a jụọ ya. Nwaada gara n'ihu kwuo na nke a mere o ji chee na igbu onwe ya kaara ya mma. Ọ dọkwara ndị mmadụ nwere obi ịdamba aka na ntị ka ha gaa n'ụlọọgwụ iji nyere onwe ha aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55217215,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55217215,Lee ihe nọ n'ụlọ Mungo Park n'Asaba,Ndị na-arụ n'ụlọọkpụ Mungo Park akọwaala etu ụfọdụ ndị ọcha dịka Mungo Park si bata na mpaghara osimiri Naịja nke ala Igbo tupu e kpokọta Naịjirịa ọnụ.,Otu n'ime ndị nlekọta a bụ Okongwu Nnenna sị na ọ bụghị Mungo Park chọpụtara osimiri Naịjia dịka akụkọ si ekwu kama na ọ gbara mbọ ka ọ chọpụta ebe osimiri Naịja bidoro. Ọ gara n'ihu kwuo na Mungo Park na ndị otu ya nwụrụ mgbe ụgbọmmiri ha kpuru ebe ha na-achọ mbido osimiri a. Okongwu gara n'ihu sị na e mechara umunne abụọ a kpọrọ 'Lander brothers' mechara bata na mpaghara osimiri Naịja. Kirie ihe niile ọ kọọrọ BBC Igbo n'uju. Ndị hụrụ maka akụkọ a: Chris Sanctus Okereke na Chiemela Mgbeahuru afirika-49503655,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49503655,South East Flooding: 'Ndị bi n' ikpere mmiri ọkachasị ndị bịdebere Osimiri Naija gbabanụ ọsọ ndụ- NEMA,"Ndị ngalaba gbatagbata nke gọọmenti etiti a kpọrọ 'National Emergency Management Agency (NEMA) n'ịchafụ, nakwa ndị nke Anambara steeti a kpọrọ State Emergency Management Agency (SEMA) amaala ọkwa ka ndị bị n'ikpere mmiri ọkachasị ndị bi nso n'Osimiri Naija kee nkwụcha ma bido n' ụtụtụ chọwa ewu ojii.","Ọkwa a bụ maka idemmiri a na-atụ anya na ọ ga-awakpo ndị bi na mpaghara ahụ. Onye na-achịkọta NEMA nke Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa bụ Manfred Anusim gwara BBC na ha agaala na ọbodo idemmiri ga emetụta wee gwa ha ihe ha ga-eme. Manfred Anusim kwuru na ọ bụ nyochapụta nke odinihu ndị ""Nigerian Meteorological Agency' (NiMet) mere maka mmiri ozizo na nke ndị 'Nigerian Hydrological Services Agency' (NIHSA) mere maka idemmiri ka ha ji arụ ọrụ. Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị' Ọ kwuru sị: ""Anyi bu ụzọ agwa ndị idemmiri a ga-akacha emetụ tupu anyị agawa ebe ndị ọzọ ọgaghị erutecha."" Anusim kwukwara na ọ bụ obodo ndị di na Anambra-North na Anambra-East ọkachasị ndị okpuruọchịchị dịka Ayamelum ka idemmiri a nwere ike imetụ karịa. O kwukwara na ha ehiwela ebe ndị gbatagbata ga-anọ nyere ndị idemmiri a ga-emetụta aka. Ebe ndị gbatagbata a dị n'elu ugwu nke mere na idemmiri agaghị erute ya. Anusim mere ka BBC mata na nsogbu ha na-enwe bụ na ụfodụ ndị anaghị ekwe abịa n'ụlọ gbatagbata gọomentị hibere. Kama n' agbanyeghị nke a, ha agwala ndị mmadụ niile bi ebe ndịa ebe ụlọ gbatagbata ndị ahụ dị. Mapụ Idemmiri Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri ga-amasị gị: Idemmiri na-achọ ịchụpụ ndị mmadụ n'ụlọ n'Enugu" afirika-45373422,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45373422,Fọm N55M: Ihe ndị ntorobia na-ekwu maka akwụkwọ ikike PDP na APC,Ọtụtụ ndị ntorobia na-azọ ọkwa ọchịchị dị iche iche na Naịjirịa ka na-ebe akwa maka akụkọ pụtara ụbọchị ole na ole garaaga na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka APC na PDP jiri nnukwu ego na-ere akwụkwọ ikeke otu ha ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala.,"Ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu na anaghị ebinye aka na ntuliaka 2019 Akụkọ a kọwara na otu Peoples Democratic Party na-ere akwụkwọ ikike ha nde naira 12 (12 million naira) nakwa All Progessives Congress na-ere nke ha nde naira 55 (55 million naira). Ihe ndị ntorobia na-azọ ọkwa ọchịchị na-ekwu maka akwụkwọ ikike otu PDP na APC BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị ntorobia were ebumnuche iso ịzọ ọkwa ọchịchị nke ala a, ajụjụ ọnụ maka akụkọ a. Kingsley Okeke Aru bụ onye na-apụta dịka onye omeiwu nta n'ime Anambara steeti gwara onye ntaakukọ anyị na udi akụkọ a na-agbawa obi. O kwuru na ""Udị ihe a bụ ihe na-ebute izu ohi n'ọchịchị ala anyị Naịjirịa, ụdị ihe a anaghị enye ndị ntorobia dịka anyị obi nkwadebe ịzọ ọkwa ochịchị n'ala a"" Chinedu Oyegbula bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Imo steeti gbara ajụjụ ọnụ nke ya. Ọ jụrụ ""Biko gwa m, onye wepụtara ụdị ego a maka ị zọ ọkwa ọchịchị, ọ ga-ewepute obi ya niile ruo ọrụ? Onye a ga-aba gọọmentị zuo ohi"" Eunice Atuejile bụ nwata nwaanyị chọrọ ịpụta dịka onyeisiala Naịjirịa gwara onye ntaakụkọ anyị ""Udi ihe a bụ ihe na-enye anyị obi ike ị gbam mbọ hụ na-anyị soro n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị a. Akụkọ a pụtara na ruo ugbua ndị na-achị ala Naịjirịa asọghị ka ndị ntorobia tinye aka n'ọchịchị ala a."" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45252914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45252914,Buhari agaala ịgba Sallah na Daura,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari agaala obodo ya bụ Daura ebe ọ ga-anọ agba sallah nke afọ a. Cheta na Buhari ka si London ebe ọ gara ezumike ọ nọrọ ụbọchị iri na ise, lọta ụbọchị abụọ gara aga. Ọchịchị Naịjirịa Nwaafọ Igbo na-azọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa bụ Kingsley Moghalụ, gwara BBC Igbo na o nwere mkpịsị igodo e ji agbape akụnaụba Naịjirịa. O kwuru na oge eruola mgbe a ga-akwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị. Mba Ofesi: Onyeisi ndị ụka katọlik na gburugburu ụwa niile bụ Pope Francis, akatọọla omume ịmetọ ụmụaka n'ụzọ mmekọahụ na mkpuchi ndị na-eme ya, n'ime akwụkwọ ozi o degaara ndị katọlik niile. Ọ rịokwara mgbaghara na ha emeghị ihe ọsịsọ maka onye ụkọchukwu mba Amerịka e jidere. N'egwuregwu, Naịjiria agbanarịla iwe ọkụ FIFA ka ha gere ntị n'iwu kwuru ka ha kpọpụta aha Amaju Pinnick dịka onyeisi otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF. Cheta na taa bụ ụbọchị ikpeazụ FIFA nyere Naịjirịa ịkpọpụta ya maọbụ a machie ha isonye n'asọmpi bọọlụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ọnụ na-eru n'okwu n'egwuregwu akọwaala ụfọdụ nsogbu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị na-enwe na Naịjirịa. Gọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa." afirika-47172610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47172610,Election Boycott: Ihe mere na ụmụ Igbo agaghị ege Nnamdi Kanu ntị - Nnia Nwodo,Nnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ otu jikọrọ ndị Igbo niile.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo mere, agba nke atọ, Nwodo kọwara na dịka oku atụla ntuliaka Ipob kpọrọ adịghị ire na Anambara steeti oge e mere ntuliaka gọvanọ, ọ gaghị adịkwa ire na ntuliaka 2019. O kwukwara maka nhazighari Naijiria na mpaghara, na mpaghara nke a kpọrọ 'restructuring.' Gee ihe o kwuru n’uju:" afirika-48013283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48013283,Kaduna Kidnapping: Nwaanyị dị ime so na mmadụ ise a tọrọ ụbọchị Easter - Uweojii,"Ndị uweojii Kaduna steeti kwuru na ndị ntọ tọrọ mmadụ ise gụnyere otu nwaanyị dị ime n'ụlọ ha n'ebe elekere abụọ nke ụzọ ụtụtụ, ụbọchị ụka bụ ụbọchi iri abụọ na otu nke ọnwa Epreelu n'obodo Nariya dị na Kaduna steeti.","Nwaanyị dị ime so na mmadụ ise ndị ntọ tọrọ na Kaduna Nke a na-eme dịka ndị ntọ gburu mmadụ abụọ - nwaanyị onye mba Briten na otu nwoke one Naịjirịa - ma tọrọ mmadụ atọ ndị ọzọ n'akụkụ Kaduna steeti ọzọ n'ụbọchị Fraịde. Ndị bị n'obodo Nariya dị na Kaduna steeti pụtara n'igwe ụbọchị ụka mee ngagharịiwe maka mmadụ ise ahụ a tọrọ n'obodo ha ma gbochie okporoụzọ awara awara Nnamdi Azikwe Expressway ebe elekere asatọ nke ụtụtụ iji gosi iwe ha. Ha kwuru na ntọ bụzị ihe na-eme kwa ụbọchị na ogbe ha na-emeghị onye na-agbagha ya. Akụkọ sị n'obodo ahụ na-ekwu na ọ bụ ụmụnwaanyị dị ime abụọ na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ ndị ihe ahụ metụtara. Otu onye bi nso ebe ihe mere nke achọghị ka a kpọ aha ya kwuru ya hụrụ ndị ntọ ahụ be e ha ji, ""Ahụrụ m ka ha ji egbe wakpo ụlọ onye agbataobi m ma tọrọ ụmụnwaanyị abụọ dị ime, otu nwaanyị n'ụlọ ọzọ nakwa otu nwoke."" ""Ike ndị ntọ na-aka ike n'ogbe a agwụla anyị."" ""Anyị na-egbochi ụzọ ka gọọmentị were hụ ihe anyị na-agabiga. Anyị chọrọ ka gọvanọ gbatara anyị ọsọ enyemaka."" Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Yakubu Sabo gwara BBC Igbo n'ekwentị na; ""ụbọchị ụka, o nwere ndị wetara ozi na ndị ntọ bịara n'obodo Nariya ahụ tọrọ nmmadụ ise."" ""Ngwa ngwa ozi ahụ batara, DPO mpaghara ebe ahụ kpọrọ ndị otu ya gaa nyocha mpaghara ahụ iji mara ma ha aga-enweta ndị tọ ahụ na ndị ha tọrọ mana ndị ntọ ahụ agbawarala."" Sabo gbara ama na ndị ntorobịa obodo ahụ mere ngagharịwe gbochie okporoụzọ awara awara maka odachie ahụ, ebe ndị uweojii gbosasịrị ha, n'ihi na ha ""achọghị ka ndị omekome jiri ya bute mkposa obodo.' Oge BBC Igbo jụrụ ya ka ọ kọwapụta ndị a tọrọ, Sabo kwuru na ""ndị uweojii ka na-eme nyocha ha"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49897711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49897711,Xenophobia in South Africa: Buhari ga-amata ọnọdụ ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka,Buahri ga-awụchi Saụt Afrịka echi,"Akụkọ dị mkpa: Onyeisiala Buhari ga-ahapụ Naịjirịa gawa mba Saụt Afrịka echi izute onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa bụ ebe ọ ga-anọ abalị atọ. Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu sị na njem a bụ maka mkparịtaụka ọdị mma ndị Naịjirịa bi na mba ahụ. Cheta na onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyrila Ramaphosa kpọrọ onyeisiala Buhari oku a maka iji hazie mmekọrịta dị mma n'etiti mba abụọ a. Njem a na-abịa n'ime izuụka ole na ole mwakpo 'xenophobia' mere na mba Saụt Afrịka ebe e bulatara ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na mba ahụ. Onyeisiala Buhari na ụmụafọ Naịjirịa na mba Saụt Afrịka ga-enwe mkparịta ụka dịka Garba Shehu si kwuo. Ihe Peter Obi kwuru maka Naịjirịa Dịka Naịjirịa mere emume ncheta ụbọchị nnwere onwe ya taa, ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu banyere ọnọdụ ya. Peter Obi chịburu Anambra Steeti sị na nchekwa, mbite ego, na e nweghi ọrụ so na nsogbu ndị chere Naịjirịa n'ihu. N'ofesi Ndị uweojii agbala otu onye n'ime ndị na-eme ngagharịiwe megide gọọmentị Chaịna na Họng Kọng egbe n'obi ya Nke a bụ mbụ a na-agba mmadụ ezigbo mgbọ egbe n'ime ngagharịiwe a chụwarala izuụka anọ. N'egwuregwu Asọmpi Uefa Champions League nke izuụka abụọ ga-ebiri ọkụ n'abalị a ebe otu egwu ndị dịka PSG, Bayern Munich ga-apụta ihe. Ndị ọzọ gụnyere Juventus, Man City, Bayer Leverkusen, Tottenham na Atletico Madrid. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44296317,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44296317,Akụkọ kachasị n'abalị a: Imechala ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya - PDP,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa,Imechala emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya - Secondus Ihe nke ikpeazụ ị ga-eme emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya bụ okwu onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus. Nke a bụ okwu ọ gwara onyeisiala Mohammadu Buhari n'emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya. A chụọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị secọndịrị maka otu nzuzo Otu na-ahụ maka ụlọakwụkwọ Secọndịrị n'Enugwu achụọla ụmụakwụkwọ itoolu nke Urban Girls Secọndịrị dị n'Enugwu. Onyeisi oche otu ahụ bụ Ọkaiwu Nestor Ezeme kwuru na-achụrụ ụmụakwụkwọ ndị a maka ị nọ n'otu nzuzo. Akụkọ mba ofesi; Otu nwoke egbuola ndị uweojii abụọ na Belgium Otu nwoke gbaburu ndị uweojii ụmụnwaanyị abụọ na otu onye ọzọ n'obodo Liege dị na Belgium ma kpachie otu nwaanyị bụ onye nzacha na mgbocha ụlọ Nwoke a bụ onye na-amaghị ebumnobi gbajikwara ndị uweojii abụọ ọzọ ụkwụ tupu egbuo ya. N'egwuregwu; Onye mịnịsta egwurewgu na ndị ntoroọbịa bụ Solomon Dalung agwala ndị NFF ka ha hapụ ihe ọ bụla gbasara ntuliaka ma lekwasị anya n'iko mba ụwa nke Rọshịa 2018 O kwuru nke a maka nsogbu dị n'etiti Chris Giwa na onyeisi NFF bụ Amaju Pinnick. Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Mberede nwa m egbuola m na ndụ' afirika-51273067,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51273067,"Southeast Politics: Mbaka, ị bụghị onye Yahoo Pastor - Charly Boy","Charly Boy bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa, ma bụrụkwa onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere ihe na-eme na Naịjirịa, ọkachasị ebe ọ na-emetụta etu ndị na-achị si achị.","Jụọ ndị na-achị gị ihe ha ji akụnaụba ọha mee - Charly Boy Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Charly Boy dụrụ ndị a na-achị ọdụ ma sị ka ha gbado anya n'etu e si achị ha nakwa hụ na ndị na-achị mba Naịjirịa jidere ha ọfọ. Gee ya ntị n'ihe nkiri dị n'elu. Akụkọ ga-amasị gị 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'" afirika-46249854,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46249854,Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a,"Buchi Atuonwu, onye a maara dịka ""Buchi"" bụ otiegwu ụka ama ama na Naijiria nakwa mbaụwa.","Mana ọtụtụ amaghị na nwa amadị a bụ onye Oboro n’Abia steeti, bụ onye nkuzi mahadum ma bụrụkwa onye derela ọtụtụ akwụkwọ. Ọtụtụ amaghịkwa na Buchi bụ onye na-akwa akwa nke a maara dịka ""fashion designer"" na Bekee. Ọ bụkwa onye otu nzuzo tupu o chegharịa ma jirizie egwu na-agbasa oziọma. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Buchi onye e ji egwu ‘Mma Mma” mara, tupenyere ụmụ Igbo azụ etu ije ya na iti egwu siri bido. Lee ya n’uju:" afirika-45469940,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45469940,Lee ihe mere Imo steeti ji ewu ewu n'izu a.,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Rochas achụọla ndị ọrụ ya Rochas Okorocha na ndị pati ya bụ APC na enwe ọgbaagha n'Imo steeti Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha azaala n'ọrụ mmadụ 13 bụ ndị ọrụ ya ọ sị na ha chọrọ ịsonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Sam Onwuamedo bụ odeakwukwọ mgbasa ozi ya tinyere aka n'akwụkwụ ozi ejiri zisaa ya bụ ozi. Ọkụ ga-adị ma ụnụ tinyere m akwụkwọ 2019 Muhammadu Buhari kwere nkwa na ọkụ latrik ga-adị gbanyuu ma ọchịwa na 2015 Onyeisiala Buhari ekwusiele ike na ya ga etinye anya na ụkwọ ọnwa ọpeketempe ndị ọrụ ma ya lọhachite na ọchịchị. Ọbụ sịnatọ Ita Enang bụ ojeozi ya na ihe gbasara ụlọọmeiwụ gwara ndị nta akụkọ nke a. UN sị sị nyochaa Rodrigo isi Rodrigo Duterte malitere ịchị Phillipine n'afọ 2016 Otu na ahụ ma ikike dịrị onye na United Nations ekwuola na-ekwesiri inyocha isi aka na achi Phillippines maka ajọ agwa ọkpara. Rodrigo Duterte gụnyere onye ọrụ UN bụ Victoria Tauli-Corpuz na ndị omekataraihepuujo ndị mba ahụ nyere ndị ụlọikpe ha. Asompi ọkaibe ụmụnwaanyị amalitela na Urop Asompi ọkaibe ụmụnwaanyị malitere na afọ 2001 N'egwuruegwu, nke na-akpọtụ tata bụ champions legue nke ụmụnwaanyị. Ị chọọ ịmata ka ihe siri kwụrụ na ya lee asọmpị ụmụagbọghọ bụ nke malitere kemgbe elekere atọ tata. Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Dasuki Galandanchi nyere ịdọ aka na ntị a oge ya na ndị nchekwa ndị ọzọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Owere. Galaanchi rịọrọ ka ndị mmadụ gawa mkpa ha ụbọchị ahụ ghara irube isi nye iwu ndị IPOB ahụ. Ipob tiri iwu ahụ iji cheta ndị tufuru ndụ ha oge ndị agha Naịjirịa gbara 'Egwu Eke' na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'afọ 2017. Ohaneze ndị Igbo arịrọla ka Ndigbo nọrọ na steeti ebe ha bi tụọ vootu na ntuliaka na-abịa na 2019. Onyeisi Ohaneze na Niger steeti bụ Emmanuel Ezeugo rịọrọ atụmadụ ndị bi na mpaghara ugwu ka ha nọrọ na steeti ghara ịgba ọsọ.0 Naịjirịa Ọkaiwu ukwu Naịjirịa ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ bụ Abubakar Malami ebela akwa arịrị maka ọnụọgụgụ ndị na-eche ikpe nọ na nga. Malami kwuru na ọ bụ ihe anya mmiri na ndị na-eche ka e kpee ha ikpe bụ ihe mere pasentị iri asaa ndị nọ na nga na Naịjirịa. Na mba Ofesi Onyeisiala mba Tanzania bụ John Magufuli agwala dị na nwunye ka ha ghara ime ihe ga-akwụsị ha ịmụ nwa kama ka ha na-amụ na-aga. Magafuli kwuru na ọ bụ ndị ume ngwụ na-akwụsị ịmụ nwa nke merela na ọnụọgụgụ ọtụtụ obodo na mpaghara Yurop adaala. O kwuru okwu a n'ihu onye ọrụ mba un na-ahụ maka iwebilata ọmụmụ na Tanzania bụ Jacqueline Mahon nakwa mịnịsịta ahụike ha bụ Ummy Mwalimu. Tanzania nwere mmadụ nde 55.7 wee na-achụ nde 60 ọsọ Akụkọ ebe ndị ọzọ Otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ World Health Organisation (WHO) na Bekee ekwuola na nkwụgbu onwe abụrụla ihe abụọ na-ebute ọnwụ na mbaụwa niile. Ha kwuru na ọnwụ nkwụgbu onwe butere ọnwụ mmadụ puku narị asatọ (800,000) n'etiti ndị dị malite n'afọ 15 rue afọ 29 n'afọ 2016. WHO kwuru nke a taa iji cheta ụbọchị e wepụtara iji kwụsị ọnwụ nkwụgbu onwe n'ụwa ebe ha kwuru na ndị mmadụ na-egbu onwe ha karịa na mba ndị gbalitere mana ọtụtụ ndị na-egbu onwe ha bụ oge ha na-aganiga ihe siri ike. N'egwuregwu Onyeisiala mba Tanzania bụ John Magufuli agwala dị na nwunye ka ha ghara ime ihe ga-akwụsị ha ịmụ nwa kama ka ha na-amụ na-aga. Magafuli kwuru na ọ bụ ndị ume ngwụ na-akwụsị ịmụ nwa nke merela na ọnụọgụgụ ọtụtụ obodo na mpaghara Yurop adaala. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile FRSC adọọla ndị ọkwọọ ụgbọala n'Ebonyi aka na ntị Federal Road Safety Coorp. Ndị ọrụ Federal Road Safety Kọmishọn adọọla ndị bị na Ebonyi steetị aka na ntị na ha ga amalite inwụchị ma taa ndị kpọrọ ekwo-nkụ na ha agaghị etinye igwe eji akwụsịnata ụgbọla ọke ọsọ akpọrọ Speed Limiter na Sụpịrịsụpịrị. Onye nchịkọta ha na steetị ahụ bụ Stella Uchegbu kwuru na nke a dị mkpa iji chekwa ndụ ndị na-eme njem n'ọnwa mba a anyị nọ n'ime ya. Akwusịla ịgbawa okwute n'Abuja Gọọmentị etiti akwusịlatala ịgbawa okwute n'akụkụ ebe ọmajijiji mere na Mpape, Abụja. Minista na-ahụ maka ihe egwuputere n'ala bụ Abubakar Bawa Bwari mere nke a iji nye ohere ka ndị komiti ehibere maka ịnyonye anya n'ihe butere mbuze ahụ rụchaa ọrụ ha. Na mba ofesi, aka akparala onye meruru mmadụ ahụ na Paris Ndị uweojii na France N'ofesi, ndị uweojii ekwuola na mmadụ asaa meruru ezigbo ahụ n'aka otu nwoke ji mma na mgbọrọ na mba France. Anwụchiela ya bụ nwaamadị nke ha sịrị na o sị mba Afganistan were bata mba ahụ. N'egwuruegwu Serena Williams apụọla na US Open Serena bụ Ezenwaanyi na Tenis N'egwuruegwu, Naomi Osaka nke Japan apịapụla Ezenwaanyị Serena Williams mkpụrụ ọkwụrụ n'anya na US Open. Serena kparịrị onye ogbu opi egwuruegwu ahụ maka aka enwe ọ sị na ya hụrụ na bụ ofe bụ nke adara ya nha maka ya bụ mkparị. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala" afirika-46854672,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46854672,#Ekitimourns: Gwongworo akwọpiala mmadụ 12 n'Ekiti - Ndị uweojii,Ndị uweojii nọ n'Ekiti steeti agwaala BBC etu gwongworo si gbuo mmadụ ruru iri na abụọ ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ n'Iworoki dị n'Ekiti steeti.,"Ọnụ na-ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahụ bụ Caleb Chukwu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'elekere itoolu n'ọma nke mgbede satọde gara aga bụ Jenuwarị iri na abụọ. End of Twitter post, 1 O kwuru na ụgbọala ahụ kụrụ ụgbọala Camry wee gbaba n´ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ kwọgbuo ha ma gbabakwazịa n'otu ụlọ dịketere ụzọ. O kwuru na ya bụ gwongworo bu osikapa mana o nweghị ike ịkọwa onye nwe ya. Ndị nzọpụta nọkwa ebe ahu ugbua na-ahụ na ha zọpụtara ndị tọrọ n'okpuru ụgbọala ahụ. Chukwu kwuru na e bugala ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlo ozu ma kpọgaa ndị merụrụ ahụ ụloọgwụ. Otu onye nọ mgbe ihe a mere kwuru na ọ kara aka njọ maọbụrụ na ụmụakwụkwọ Mahadum Ekiti pụtara izụ ahịa makana ya bụ ahịa diketere nso ebe ha bi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44384129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44384129,Akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ,Otu onye bụbu onyeisiala mba Tanzania bụ Jakaya Kikwete na ndị mịnista isii ekwuola na ha ga-aga mmemme akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ a ma ama na mba ahụ taa bụ Maria na Consolata.,"Maria na Consolata kwuru okwu ịlụ di mgbe ha ka nọ ndụ. Ụmụejima nwụrụ ụbọchị Satọde site na nsogbu obi. A ga-ebu ha n'otu agbati ma likwa ha n'otu ili n'ebe a na- eli ozu a kpọrọ Tosamaganga dị n' Iringa, ọdịda-anyanwụ Tanzania dịka a ga-eji obe abụọ were soro ozu ha gaa. Maria na Consolata Mwakikuti ndị jikọrọ bido na utube gbada nwerịtara otu imeju, akpaụme (lungs) mana ha nwere mkpụrụobi, abụọ, isi na aka dị iche iche. Akụkọ ga-amasị gị:" 42726653,https://www.bbc.com/igbo/42726653,"England, Poland ga-eso Super Eagles sọọmpi enyi na enyi","Naijiria na ala Poland, Serbia, DR Congo, England na Czech Republic ga-asọ mpị enyi na enyi maka nkwadebe iko mba uwa ga-eme na ala Russia na afọ 2018.","Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi Otu Super Eagles na Poland ga asọ mpi n'ụbọchị ịrị na atọ na onwa Maachi. N'ụbọchị anọ ga-abịa n'iru ka Naijirịa na Serbia ga-asọmpi. Otu England na Naijiria ga-asọmpi n'ubọchị abụọ n'onwa Juunu. Ka o si ga-adị Onye nkuzi otu Super Eagles bụ Rohr kwukwara na asọmpi nke a di ezigbo mkpa makana ọ ga dị ka egwuregwu ga-eme na Russia. Nke a bụ asọmpị enyi na enyi niile nke Nigeria maka nkwadebe egwuregwu ịko mba uwa: Ndị Super Eagles Naịjirịa tozuru ịga asọmpị ịko mba uwa n'afọ 1994, 1998, 2002, 2010 na 2014 mana ha agaghị n'afọ 2006." afirika-45683069,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45683069,Ogbaru: Ahụla ozu Okechukwu Osadebe bụ onye idemmiri gburu,Ozi na-eru BBC ntị na-akọwa na ahụla ozu nwa onye egwu ama ama nke lagoro mmuo bụ Osita Osadebe bụ nke idemmiri gburu ụnyahụ bụ Fraịde.,"Idemmiri emebiela ọtụ ihe na Naịjirịa n'afọ a Okechukwu Osadebe na mmadụ abụọ ndị ọzọ na-aga mgbe ya bụ idemmiri chịpụrụ ya ụkwụ n'ala, dịka nne ya bụ oriakụ Amaechi Osadebe sịrị kwuo. Ụlọọrụ ntaakụkọ ABS kwuru an ya bụ ihe mberede mere n'abalị ụnyahụ mgbe enyeghị dị ya na Okechukwu so ohere ịzọpụta ya maka ka ya bụ idemmiri sị achị ọkụ. Ha kwụkwara na onyeisi okpuruọchịchị ọgbarụ bụ Arinzechukwu Awogu emelarị njem itiaka n'obi n'ezinaụlọ Osadebe bụ ebe ọ nọ dọọ ndị mmadụ aka na ntị maka idemmiri. Akụkọ ga-amasị gị Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya" afirika-44036596,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44036596,Ndị uweojii: Ọkaiwu gburu di ya chere ya eche,Kọmịshọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi gwara ndị ntaakụkọ na onye ọkaiwu aha ya bụ Udeme Odibi nke ji mma sụgbuo di ya chere ya eche tupu o me ya.,"Oriakụ Odibi, onye dị afọ 37, ekwetela na o mere ya bụ ihe. Odibi ji mma bepụ ihe di ya ji bụrụ nwoke, nye ya n'aka ma sukwa onwe ya mma n'ụbọchị Tọzde gara aga. Dịka Imohimi siri kọwa, nwaanyị ahụ nke ya na dị ya lụọla dị na nwunye afọ atọ gara aga na amụtaghị nwa, zụrụ mma ọhụụ o jiri gbuo di ya dị afọ 50. O kwukwara na Otibi chịkọta asambodo ya, ma kwadokwa onwe ya maka iji ụgbọelu ifepụ ga mba Briten n'ụbọchị Tọzde. O kwuru na nwaanyị ahụ kpọrọ agbataobi ha, nwanne di ya nwaanyị nakwa nne di ya gwa ha na di ya kwuru na ọ ga-egbu ya. Imohimi sị, "" A ka na-eme nchọpụta ihe mere nwoke ahụ n'ụlọọgwụ Lagos State University Teacching Hospital, Ikeja, ebe nchikọta nyocha ihe mere nke anyị ga-ekwupụta gwa ọhanaeze ka na-aga n'ihu."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-57296022,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57296022,State CID Umuahia attack: Ndị omekome amụnyela ya ọkụ,"Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị omekome mụnyere ụlọọrụ ndị uweojii a ma dịka 'State CID' nke dị n'Umuagu, Umuahia, Abia steeti, ọkụ.","Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi banye n'ụlọ ebe ndị uweojii na-edebe ngwaọgụ nke Bekee kpọrọ 'armoury', mana ndị uweojii gbochiri ha. Ha kwukwara na ndị omekome a ji egbe nọ na-agbali egbe elu nke mere ka ndị mmadụ nọcha ma n'ebe a ma dịka 'isi gate' rie mbombo ọsọ maka ndụ ha. Otu onye ọzọ hụrụ ka ihe mere kwuru na mgbọ egbe tụgburu otu nwaokorobịa na-anya keke. Ka ọ dị ugbua, a na-achọ ịmenyụ ya bụ ọkụ, dịka ndị na-ere ahịa gbachichara ọdọahịa ha ma gbara na-ala n'ụlọ ha. Akụkọ ka na-abịa." afirika-49747894,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49747894,Nwoke kwere ka agwọ 200 taa ya iji chọta ọgwụ agwọ maka mbaụwa,"Kwa nkeji ise ọbụla, otu onye nọ otu ebe na-anwụ site n'arụ agwọ tara ya, ebe mmadụ anọ nwere ike ibute ọrụsị site n'arụ agwọ.","Nanị ntụsa onunu agwọ ojii mamba abụọ nwere ike igbu mmadụ Mana o nwere ụfọdụ ndị kara obi jiri agwọ eme nchọpụta. Tim Friede, onye bi na Wisconsin dị na mba Amerịka sere onwe ya ihe onyonyo ebe ọ kpachara anya hapụ ka agwọ ọjọọ taa ya ma tinyekwa ihe onyonyo ndị a na 'Youtube.' Ihe ụfụ ozigbo ozigbo Mgbe ụfọdụ Tim Friede na-akọwara ndị na-ekiri ya na YouTube etu ọ na-adị ma agwọ ọjọọ taa mmadụ N'otu ihe nkiri a, ka agwọ ọjọọ a kpọrọ mamba tachara ya, ọ gbara ọbara na-apụ ya n'aka nkịtị na-ekwunye okwu n'igwe na-ese ihe onyonyo. ""A bịa n'agwọ ojii mamba, ụfụ ya na-abịa ozugbo. Ọ na-adị ka otu puku aṅụ ịgba mmadụ. Aṅụ na-enwe onunu inu (venom) otu miligram maọbụ abụọ mana agwọ 'mamba' taa gị, o nwere onunu inu ruru narị miligram atọ maobu nari ise (300-500 milligrams.)"" Ọ gwara BBC ihe mezịrị: O kwuru sị, ""O bidoro zawa azawa ka nke a mechara. Ụbọchi ole na ole na-eso ya, o jituru m. Site n'ụdị ọziza ọ zara m nwere ike ikwunwụ onunu inu ole agwọ ahụ tanyere m n'ahụ. Ọ fụrụ m ezigbo ụfụ."" Ọ dị oke egwu, o zighị ezi Mana ọ bụghị onye ọbụla ka ihe na-atụ n'anya dịka o si atụ ndị ihe ya na-amasị na YouTube. Tim Friede sị na ahụ ya etichiela nke na onunu inu agwọ agaghị emeli ya ihe ọbụla Dkta Stuart Ainsworth nke si n'ụlọakwụkwọ 'Liverpool School of Tropical Medicine' kwuru na ""Ihe ndị a na-eme edoghị anyị anya. O zighị ezi. Nnukwu egwu dịkwa na ya. Anyị na ha anaghị arụkọ."" Ụlọ mmụta ya so na ndị na-achọ ọgwụ agwọ ozuru mba ọnụ ọhụrụ. Ihe na-eme bụ na a na-ebu ụzọ tulee ọgwụ mgbochi ọhụrụ n'ahụ oke na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ. Ọ bụ naanị oge o doro anya na ọ gaghị emerụ mmadụ ahụ ka a na-atụle ya n'ahụ mmadụ. Dkta Ainsworth sị,""Ndị mmadụ nwere ike inweta ọdaeshi agwọ site n'ime ka agwọ taa ha n'ihi na o nweghị iwu mabidoro ya. Mana ụdị ihe nwere ike ibute ọnwụ. Mmadụ ekwesịghị ime ya."" Mana n'ụlọrụ na-emepụta ọgwụ agwọ niile dị na mbaụwa, e nweghị ntụziaka etu o kwesịrị ka e si na-eme nchọpụta maka ọgwụ agwọ Dịka 'Wellcome Trust', otu mba Briten anya ha dị n'imepụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ si kwuo, ""E nweghị usoro mmepụta, nchekwa maọbụ nhazi zuru ọnụ onye ọbụla na-agbaso."" Ikwe ọnwụ ọnụ Friede kwusiri ike na ọ bụghị eziokwu na ya n'etinye ndụ ya n'ọnụ ọnwụ iji nweta ndị na-eso ya na soshal midia. ""E meghị m ya iji mee ihe onyonyo YouTube - Achọrọ m ịzọ ndụ nakwa ime ihe pụrụ iche na ndụ ndị mmadụ. ""Eji m YouTube achọ ndị dọkịta mụ na ha ga-arụkọ. Ọ bụ ihe a maghị ma ọ ga-enwe isi. O nweela isi."" Tim Friede kwuru na ya eruola ọnụ ọnwụ site n'arụ agwọ ugboro iri na abụọ N'ime ụdị agwọ ruru 3,000, naani 200 nwere onunu inu kajara akaja nke nwere ike igbu mmadụ maọbụ kụọ ya ngwụrọ. Friede macha ha niile. Ọ masị ya bụrụ nke a kpọrọ 'cobra, 'viper' maọbụ 'mamba', o diela ụfụ arụ agwọ tara ya n'afọ iri abụọ. Nke a gbakwụnyere ugboro 700 ọ gbanyere onwe ya onunu inu agwọ n'ahụ. Oke onunu inu agwọ nwere ike ịtanye mmadụ na-adị icheiche. Ụfọdụ, agwọ nwere ike ịta gị na-agbanyeghị gị onunu inụ ọbụla n'ime. Friede sị, ""Ọ bụrụ na ahụ gị etichibeghị n'ebe agwọ dịka mamba nọ, o nwere ike ime ka ekoume (diaphragm) gị nke na ị gaghị ekuli ume. Anya gị agaghị ekwe mmepe, ị gaghị ekwuli okwu, ị ga na-agba ruo oge ahụ gị kpọnwụrụ mana uche gị ka ga na-arụ ọrụ ganye ma ị nwụọ."" Arụ 'Cobra' dị ọjọọ nke ukwuu Friede na-azụ ọtụtụ ajọ agwọ n'azụ ụlọ ya ma na-anwale ọtịta ha n'ahụ ya. Agwọ ojii 'mamba' bụ otu na-agwọ kachasí jọọ njọ - arụ ya na-egbu mmadụ tupu o rue nkeji 30 ọ tara mmadụ ""E nwere m agwọ cobra mmiri m si Afrịka nweta. Arụ ya na-adị egwu. Ọ na-eyi egwu."" Friede nwere nkwenye na ị na-agba onwe gị onunu inu nwayọ nwayọ, ahụ gị ga-etichi ghọọ ọdaeshi n'ebe agwọ ọjọọ nọ mana a katọrọ usoro ọ na-agbaso. Inweta 'ọdaeshi' agwọ Ọ bụ ịgbaso ụzọ yiri ya nke e ji ụmụanụmanụ eme nyere aka ka e nweta ọgwụ agwọ nke a eji agwọ arụ agwọ ugbua. A na-atụ agwọ egwu ma na-efe ya n'ọtụtụ mba Mmepụta ọgwụ agwọ enwebeghị nnukwu mgbanwe kemgbe '19th Century'. A na-agbanye nsị agwọ ya bụ onunu inu agwọ n'ahụ anyịnya maọbụ atụrụ ma mịpụta mgbochi ọbara ha ga-amụpụta. Friede sị, ""Anyị nwere anụmanụ ndị chọrọ igbu m mana achọghị m ịnwụ. Ya mere aghọ m anyịnya. Kedụ ihe bụ na-anyị agaghị echekwa onwe anyị?"" Friede , onye gbara afọ iri ise abụghị ọkammụta maka nchekwa ahụ nke ọ na-aga mahadum. Ọ bụ egwu agwọ ọjọọ ịtagbu ya mere ya dabanye na ime ihe o bidoro ime kemgbe afọ 20 gara aga. O bidoro na ududo na akpị were si na ha fere n'agwọ ọjọọ. ""Ọ bụghị agwọ niile ka m nwalerela. Ana m ahọrọ ndị na-egbu ngwangwa."" O nwere ọtụtụ apa si na nwale o merela, oruela n'ọnụ ọnwụ ọtụtụ mgbe. Mana ọ na-enye ya aṅụrị na agwọ ịta ya, o nwetakwa onwe ya na ahụghị dọkta. ""Ihe dịka ugboro 12 , inwetakwa onwe m rịara ahụ. n'otu nwale m mere n'afọ mbụ, ebugara m ụlọọgwụ eebe m hiri ka agwọ 'cọbra abụọ tachara m."" ""Ị ga-amụta ihe. O nweghị dọkịta maọbụ mahadum n'ụwa a ga-akụziri gị nke a."" Ọgwụ agwọ na-ada oke ọnụahịa ma nwekwa ike ibute nsogbu ndị ọzọ Onye ọrụ nchekwa ahụ(immunologist a kpọrọ Jacob Glanville hụrụ ihe Tim Friede na-eme n'ihe onyonyo dị na YouTube kpọtụụ ya. Ugbua, ụlọụ ya na Friede na-agba mbọ irụpụta ọgwụ agwọ pụrụ iche nke ha ji ihe si n'ihe ha mịtara n'ọbara Friede. ""Ihe Tim mere dị ịtụnanya mana ọ dịkwa egwu. Agaghị asị onye ọbụla ga-eme ụdị ihe a."" Ọrịa ndị e chezọrọ echezọ Dịka WHO siri kwuo,kwa afọ, agwọ na-ata mmadụ ruru nde ise na ụma anọ ( 5.4 million). Ndị na-anwụ na-eru bido na 81,000 rue 138,000. Ihe karịrị 400,000 bụ ndị na-esi narụ agwọ bute ọrụsị na-ebudata ụdị ndụ ha na-ebi. N'akụkụ ụwa dị icheiche, mmadụ na agwọ na-ebiko Ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba kwa afọ bụ ụbọchị e ji agbasa ozi maka arụ agwọ. Nke a bụ ji mee ka ọhaneze lenye anya na nsogbua na-akpa ike na obodo dịga n'Afrịka, Asia nakwa South-Amerịka. N'ọtụtụ mba, ọgwụ agwọ e nwere anaghị arụcha ọrụ n'ihi etu e siri dokwaa ya maọbụ maka na e mere ya maka ụdị agwọ pụrụ iche , ọ bụghị agwọ niile. Iji isiike gboo mkpa Ọtụtụ ndị ọkammụta sayensị akatọọla Glanville na Friede maka ihe =ha na-eme mana ha kwusiri ike na nchọpụta ha na-eme. Tim Friede sị na nnwale kara aka bụ maka ọdịmma ụwa Glanville sị, ""Anyị elebanyela anya n'ọrụ ji usoro e ji elebanye ihe ndị ọịzọ nwere ike itinye mmadụ na nnukwu nsogbu dịka mmerụ ahụ n'ọrụ maọbụ HIV."" Dịka o kwetara na ụzọ ọ gbaso agaghị adịị ndị ọzọ mfe, Tim Friede sịrị na ọ ga-amịta mkpụrụ. ""O nwere uru dị n'ekweghị ekwe m. Ana m etinye ndụ n'ihe egwu iji nwetara ụwa ọgwụ agwọ ozurumba ga-adị ọnụala.""" afirika-50055796,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50055796,Ọgba mbọ: Etu m si bido ịgba mbọ - Innoson,"Innocent Chukwuma e ji Innoson mara, nwafọ Igbo bụ aka na-arụpụta ụgbọala nke mbụ na Naịjirịa kọwara etu o si malite njem ịgba mbọ ya.","Ọ gwara BBC Igbo na ọ malitere njem a dịka ndị ọzọ si amalite nke ha. Ọ sị na azụmaahịa mbụ o jiri bido bụ akụrụngwa ọgbatumtum, si na ya banye na nke ụgbọala nakwa tupu ọ banye n'imepụta plastik n'usoro ahụ. Chukwuma sị na ọ bụ ụlọọrụ plastik ya kachasị ukwuu na mba Afrịka niile. N'afọ 2007, o mepere ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala a kpọrọ 'Innoson Motors'. Ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala dị iche iche gụnyere nke ndịagha, ndị ọrụ nchekwa, nke e ji eme njem, nke e ji ekpofu ahịhịa dgz. Kirie ihe o kwuru n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Jessica Nwankwo" afirika-56114163,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56114163,Orlu Imo State: Ọ bụ anyị kpọrọ ndị agha oku enyemaka - Gọọmentị Imo steeti,Onye na-achị steeti Imo steeti bụ Hope Uzodima ekwuola na ọ bụ gọọmentị ya kpọrọ ndị agha Naịjirịa bịa nyere ha aka kpochapụ ndị echeere na ha so n'otu Eastern Security Network,"O kwuru na ọ bụ ndị otu ipob bụ ndị kpara nkata ịwakpo obodo Orlu n'aha ịchọ ndị ọchiechi na mpaghara ahụ. Ozi a bụ nke si n'aka Kọmịshọna na-elekọta ikpe ziri ezi bụ Cyprian Akolisa gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ọ na-aza ajụju gbasara ihe ndị agha na-eme n'Orlu. ""Mwakpo e mere ụlọ ndị uweojii dị ịcheiche mere n'oge #endsars bụ ndị otu ipob zoro n'okpuru ngagharịiwe ahụ iji zuru ngwa agha"" ka o kwuru Ọ bụ n'obodo Lilu nke dị n'Anambara steeti ka ụgbọelu ndị agha Naịjirịa kwara mgbọ, ọ bụghị na Orlu dịka akụkọ si ekwu. BBC Igbo agaala Lilu nke dị n'okpuruọchịchị Ihiala n'Anambra steeti iji mme nchọpụta nke bụ eziokwu maka mkpamkpa kpara n'ụbọchị Weneezde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Febrụwari 2021. Cheta na akụkọ na-efegharị na ndị agha Naịjirịa ji ụgbọelu ha na-akwa mgbọ n'Orlu ebe ha na-achụ ndị otu Eastern Security Network. Ogbunigwe ndị agha gbariri ọnụụzọ ama ndị mmadụ Nchọpụta BBC Igbo gosiri na ọ bụghị na Orlu ka ihe a mere kama o mere n'obodo Lilu. Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha zigara ụgbọelu ha na mpaghara ahụ n'eziokwu mana o nweghị ndị ha nyere nsogbu. Mana BBC Igbo chọpụtara na ndịagha ji ụgbọelu ha gbaa ogbunigwe ma kwaa mgbọ n'okirikiri ahụ. Otu nwoke kpọgharịrị ndị ntaakụkọ BBC Igbo na be ya ma gosi ha etu ogbunigwe ndịagha si gbarie akụkụ ụfọdụ na be ya. Mgbọ ndị agha mebiri akụkụ ụfọdụ n'elu ụlọ nwoke ahụ Nwoke ahụ gosiri anyị ọnụụzọ ama ya nke bekee na-akpọ gate, elu ụlọ ya (roof), elu ụlọ nke ime (celiene) nakwa akụkụ ndị ọzọ ndị agha kwara mgbọ. O kwuru na ọ bụ naanị amara Chineke mere na onweghị onye nọ n'akụkụ ebe mgbọ ndị ahụ nakwa ogbunigwe ndị ahụ dara. BBC ga-ewetara gị akụkọ a n'uju ya ma anyị chịkọtachaa mpụtara nchọpụta ndị ntaakụkọ anyị gara ime n'obodo Lilu. Ihe ụgbọ agha anyị gara mee - Ndị agha Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa kwetara na ha zipuru ụgbọelu na mpaghara Orlu mana ha anaghị enye onye ọbụla nsogbu. Orlu na-ewu na soshal midia ugbua dịka ọtụtụ na-ekwu na ndị agha Naịjirịa awakpola obodo ahụ ọzọ. Cheta na ndị agha na ndị ọrụ nchekwa Eastern Security Network kwataburu n'Orlu n'oge gara aga. Mana n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18, 2021 ka akụkọ nakwa onyonyo malitere ifesa nke na-ekwu na ụgbọelu helịkọpta nke ndị agha Naịjirịa na-akwa ndị mmadụ mgbọ na mpaghara Orlu. Oda Chioma, onye bi n'Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe gbara gharịị na-eme na mpaghara ebe o bi. O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu. BBC Igbo jụrụ Igwe Dr Patrick Acholonu, onye a ama ka Didikadi ndị Orlu, o kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha gbara egbe ma tụọ mgbọ. Etu ime obodo Orlu dị n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18 2021 Onye ọzọkwa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya anụbeghị ụda egbe n'okirikiri nke ha. O kwuru sị: ""Anyị na-ahụ helịkọpta ka ọ na-efegharị, ndị soja jukwara n'okporo ụzọ, mana udo dị. Anyị anụbeghị ụda egbe n'ogologo oge."" Ọ gara n'ihu kwuo na ụfọdụ na-akọ na ha nụrụ ụda egbe na mpaghara Okporo Orlu, mana n'akụkụ nke ha, ebe niile dị jụụ."" Anyị zigara ụgbọelu helịkọpta n'Orlu mana ha anaghị enye ndị mmadụ nsogbu - Ndị agha Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa kwetara na ha zipuru ụgbọelu na mpaghara Orlu mana ha anaghị enye onye ọbụla nsogbu. Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa, ngalaba 34 artillery Brigade nke dị n'Obinze, Owerri, Imo steeti, bụ Babatunde Zubairu, gwara ụlọntaakụkọ Punch na ha zigara ụgbọelu helịkọpta na mpaghara Orlu. Zubairu kwuru na ọ bụ n'ihi nchọpụta ha mere, nke bekee kpọrọ 'military intelligence', ka ha ji ziga ụgbọelu ndị ahụ. Onye ọzọkwa bi n'obodo Uda, Orsuihiteukwa nke dị n'okpuru ọchịchị Orlu, gwara ndị Punch na ụgbọelu ndị agha na-efegharị n'obodo ha nke tinyere ọtụtụ mmadụ n'ụjọ. Mana onye ahụ kwuru na helịkọpta ahụ agbaghị egbe ọbụla. O kwukwara na ya bụ helịkọpta fegharịchara ma fepụkwa. Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu Onyonyo dị icheiche na-agbasa na Twitter na-egosi ụgbọelu helịkọpta na-efegharị nke ndị mmadụ na-asị na ọ na-akwa mgbọ na-agbagbu ndị mmadụ. Chidi Odinkalu, onye jibu ọkwa onyeisioche 'National Human Rights Commission' tinyere otu ihe onyonyo na Twitter ebe ọ dịka Helịkọpta na-agba egbe. Aisha Yesufu, onye a ma ama na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye, kwukwara otu ihe ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya amaghị maka akụkọ a na-efegharịnụ. O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ akpọkwaala ya maka ya bụ ihe. Ikeokwu gara n'ihu kwuo, na o doro ya anya na ndị agha ka nọ na mpaghara Orlu, mana onweghịzi ndị ha na-enye nsogbu. Mana anyị na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ndị bi na mpaghara ahụ ka ha kọwaara anyị ihe na-emenụ. N'aka nke ọzọ ụlọọrụntaakụkọ Punch Rochas Okorocha agaala Orlu sị ha ka 'Ọzọemena!' Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri. Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara. O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu. Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara. N'ọnụ ya ""Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"" Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu. Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta. Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ. Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara? BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. Ka o si gaa n'Orlu n'ụbọchị nke atọ Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu. Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi. Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a: Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe. O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata. Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi. O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara Orlu Crisis: ""Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"" Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha. Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua. BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi. Lee mmadụ ole nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Orlu ụnyahụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ. O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ . Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua. Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua. Ma ndị ọrụ aka apụtaghị ọrụ taa dịka anyị si chọpụta Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a. Lee ihe Nnamdi Kanu kwuru maka ihe na-eme n'Orlu Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na ""Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ"". O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu. O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na ""Hague"". Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands. ""Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a"" - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ. Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ. Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara. O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a. Ebe ndị mmachi a metụtara bụ Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ. Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ. O kwuru sị ""ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa. O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ. O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme. Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu. Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya. Kedụ etu ọgbaghara a si bido? Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu. Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé. Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep. Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ. Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka. Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ. Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere. Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere. Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ. Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ." afirika-45357706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45357706,'Nwunye Ojukwu ị banye sineti ga-akwalite aha Ikemba'- Onyeisi APGA,Akụkọ na-eru anyị aka ugbua na-ekwu na aka chiburu Imo steeti bụ Ikedi Ohakim eweputala ndị oke ọgaranya n'ala Igbo ruru iri na ise ka ha kwado Bianca Ojukwu nwunye onye ndu Biafra nwuru anwụ n'ịzọ oche sineti ga-anọchịte anya Anambra Saụtụ na ntuliaka 2019.,"Onyeisi APGA n'Anambra kwuru na Bianca Ojukwu tozuru etozu O kwuru na ndị Igbo agaghị a nọ na-ele anya akaja nwunye Dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu. O kwuru nke a n'Ekwulobia dị n'okpuruọchịchị Aguata mgbe ha na-eme ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati APGA. Okwuru na steeti dika Imo, Abia, Ebonyi nakwa Enugwu na-ayọ ndị Anmabra ka ha mezuo ebum no obi amaka ncheta Dike Biafra bụ Ojukwu. Mana Chris Nkwonta bụ onyeisi ndị APGA n'Anambra steeti ekwuola na ọ bụkwa onye ọ bụla bụ onye Igbo kwesiri ị kwado Bianca Ojukwu n'ihi na anyị niile bụ ọgaranya n'oke anyị. Onyeisi APGA n'Anambra kwuru na Bianca Ojukwu tozuru etozu O kwuru na ọ ga dịmma ma enye Bianca ezigbo nkwado ka owee zọta ọche sineti ị nọchite anya Anambra saụtụ site na pati APGA. Gbasara ndị ya na Bianca na-azọ ya bu oche bụ Ifeanyi Ubah nakwa Nicholas Ukachukwu, Nkwonta kwuru na ha bụ dike mana agbanyeghị nke a onye bụ uche Chukwu banye ya bụ oche sineti. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a : 'Nwunye Ojukwu ị banye sineti ga-akwalite aha Ikemba'-Onyeisi APGA Na Soshal midia: @umeh_oge kwuru na ihe a bụ ihe di mma @OKEKEOLIVER2 kwuru na ọ ga-akamma ka enye Bianca oche ọchịchị kama ya ịzọ ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44125611,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44125611,Ị chọro ima afọ ole ị ga-adị n'ụwa?,"Ka a na-ekwu na ndị nọ n'ụwa ugbua na-anọ ndụ karịa ndị gboo, jiri ihe njirimara a ka ị mara afọ ole ị ga-ebiru.","Ewela iwe, megharịa ya ọzọ! Biko nyochaa ịntanetị gị ma pịa 'gosi ihe ọpụtara' iji megharịa ya ọzọ! Afọ ole a na-atụanya mmadụ ga-adị ndụ Ọ dị gị ka ị ga-enwe ahụike na ndụ gị fọdụrụ? Olileanya ndụ: N'etiti gi na ndị ụwa niile Afọ ole a na-atụanya mmadụ ga-adị ndụ mgbe a mụrụ ya, na mba (afọ) Na nkezi afọ ole a na-atụanya mmadụ ga-adị ndụ site n'ọmụmụ bụ 72 - ya bụ 70 nke nwoke na 75 nke nwaanyị. Mana, nke a na-agbanwe kwa ka ndụ na-aga. Iji maatụ, onye dị afọ 69 ga-atụ anya ibikwa afọ 17 ọzọ. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:" 52683265,https://www.bbc.com/igbo/52683265,Coronavirus update: Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego?,Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego?,Gbazie anya ka ị hụ na-ejighị akụkọ ụgha duhie gị. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo afirika-52064601,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52064601,"Igbo Musicians: Ndị otiegwu Igbo aha ha kpọtụrụ akpọtụ na 60s, 70s, na 80s","Mgbe elu bụ ala ọsa, mgbe obodo Naijiria ka bụ ụtụ, ndị Igbo nwere ndị na-eti egwu, egwu ha na-ada ụda na Naijiria nakwa mba ofesi.","Lee ụfọdụ n'ime ndị Igbo ji eje mba n'iti egwu bido n'oge Naijiria nwetachara 'Independence' na 1960 were rue afọ ndị dị n'agbata 1980: Oliver de Coque Aha a gụrụ ya bụ Oliver Sunday Akanite, onye Ezinifite, Nnewi South, Anambara Steeti, mana ihe ụwa jiri mara otiegwu a bụ 'Oliver De Coque'. Egwu o jiri pụta ọgbọ mbụ bụ Messiah Mesiah nke o wepụtara n'afọ 1977 mana egwu ya wuru ochie ochie bụ ""Peoples' Club of Nigeria, Opportunity, nakwa 'Funny Identity'. Igbo Music: Gịnị mere ndị ọgbara ọhụrụ Igbo ji eleghara ụbọaka anya? Ọ lakpuru ọtụtụ afọ, anaghịkwa anụ olu ya mana ọ pụtakwara n'ike na ebube n'ebe afọ '1990s' oge o tipụtara egwu ndị a; Biri Ka Mbiri,"" ""Ana Enwe obodo enwe,"" ""Nnukwu Mmanwu."" Oliver , onye nwụrụ n'afọ 2008 ka ọ gbachara afọ 61 bụ onye ndị ihe ya na-amasị na echeta maka etu o si mara akpọ ụbọakwara. Ụfọdụ ụmụ ya gbasoro nzọụkwụ ya n'iti egwu mana o nweghị onye n'ime ha chakerela ka nna ha. Ụfọdụ egwu o tiri Osita Osadebe A ma Stephen Osita Osadebe dịka otiegwu 'High Life' aha ya wuru ewu, ọ kachasị ka a lụchara agha dịka o tipụtara efere egwu 'Ọsọ ndị, O we ndị.' Mana o tiwelarị egwu kemgbe dịka odogwu ahụ a mụrụ n'afọ 1936 wepụtara efere egwu mbụ ya n'afọ 1958. Onye ọja Gerald Eze Onye Atani n'Anambara steeti, Osadebe chị bụ ọgbọ na Legọs ebe o bi akụ egwu tupu a gbaa ọsọ Biafra. 'Enwere m nti eji ama egwu ga-aga ahia' -Honesty Music O sobu Eleazar Chukwuwetalu Arinze (E. C. Arinze), onye nwe 'Empire Rhythm Orchestra' (ma tipụtakwa egwu ,""N'ike N'ike ka anyị ji arụ ọrụ"" na ""Biko Rapum Paulina"") agụ egwu. E mechaa sonyere ""Central Dance Band"" nke Stephen Amaechi na-edu tupu o bido nke ya ọ kpọrọ ""Nigerian Sound Makers."" Otu onye egwu ndị ochie na-amasị bụ Ron Mgbatogu kwuru na ihe mere egwu Osabdebe ji wuo nnukwu bụ na ""Ọsadebe nwere etu egwu ya si ada ka egwu ndị ọgalanya, egwu ngala."" Ụfọdụ egwu o tiri Emeka Morocco Maduka Emeka Morocco Maduka bụ otiegwu kajara akaja bidoro tiwe egwu n'afọ 1962 mana egwu ya bidoro wuwe ewu na 70s rue 80s. Onye Ukwulu dị n'Anambara Steeti Morocco tipụtara egwu ruru iri na asatọ maka nke kachasị ree ahịa bụ ""Asili '98"". Dịka o si gbaa n'ama, ọ bụ ọrụ igwe ọkụ (electrician) ka ọ na-arụ tupu ọ banye idi egwu. Maduka bụ otiegwu a ma ama n'ala Igbo maka egwu ekpili nke mere e ji akpọ ya ""Eze Egwu Ekpili"". Egwu ya na-enwe ezi nkuzi ma na-emetụta n'ọkpụkpụ. O tiela egwu afọ 60 tupu ọ nwụ n'ụbọchị 29 Ọktoba nke afọ 2020. Ụfọdụ egwu o tiri Stephen Amaechi Stephen Osita Amaechi bụ otiegwu e jiri 'highlife' mara ama. Ọ bụ ya nwe otu egwu ọ kpọrọ 'Afro-Rhythm Skies'. – Otu egwu ya bụ 'Afro Baby' Ndị mara maka ya kọwara na ọ bụ n'aka ya ka Osita Osadebe mụrụ iti egwu. Osadebe sonyekwara n'otu egwu ya tupu ọ malite nke ya. Mike Ejeagha Mike Ejeagha bụ otiegwu Igbo a ma ama n’ihi egwu akụkọ ifo ya. Ọ bụ onye Eziagụ n'Enugwu steeti. Ya mere ọtụtụ Igbo ji ya ekwu okwu sị 'akụkọ na egwu Mike e ji Agha"" mgbe mmadụ kọwara ihe na-atọ ka akụkọ ifo. Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso, Ejeagha kwuru na ya bụbu ọkpụisi tupu ya abanye iti egwu. Na nkọwa Ron Mgbatogu, na Ejeagha ""dịka onye toro n'aka ndị ochie"" nke mere ọ nụchara okwu amamihe ha were ya na-akụ egwu ma na-akụzikwara ndị mmadụ ihe. Ụfọdụ egwu o tiri gawazịa Celestine Ukwu Mgbatogu kọwara na Ukwu bụ onye e ji okwu miri emi , na olu dị ụtọ na ntị mara. O kwukwara na e ji ịkụ ngwa egwu a kpọrọ 'xylophone' nke o webatara n' egwu 'High Life''were mara. ""Ọ bụ onye jị gọọmenti na-akpọ ọ bịa tiere ha egwu."" ""Ka a lụchara agha, oge Ụkpabi Asika na-achị Eastern Region, a na-akpọkarị ya ma gọọmenti nwee emume. Ụfọdụ egwu o tiri Onyeka Onwenu Onyeka Onwenu bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ n'oge Ọchịchị Ikedi Ohakim dịka gọvanọ Imo steeti Otiegwu Onyeka Onwenụ bụ onye Arondizuogu, n' Imo Steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ n'Alabekee ebe ọ gụrụ na Wellesley College, Massachusetts dị n'Amerịka tupu ọ laghachị Naijiria bịa rụwa ọrụ. Ọ bụ onye ntaakụkọ. Ụfọdụ egwu o tiri Bright Chimezie(1960-) Bright Chimezie bụ onye e ji 'Zigima Sound' bụ ụdị egwu nke ya nke dịkwa ka 'High Life' mara. Etu o si ete ụkwụ ma ọ na-agba egwu bụkwa ihe na-atọ ndị egwu ya na-amasị ụtọ. Ọ na-akọkwa akụkọ ije ụwa n'egwu ya. Ụfọdụ egwu o tiri Nelly Uchendu(1950-2005) Nelly Uchendu bụ olu ọkwa n'ịgụ egwu chakere na 70s na 80s oge ụmụnwaanyi Igbo ịbụ otiegwu dịka ịnata iko e jiri kunye ya mmiri. Uchendu,onye a mụrụ n'afọ 1950 bidoro wube n'afọ 1976 oge o tipụtara egwu ọ kpọrọ ""Love Nwantịtị. Ihe e jiri mara Nelly bụ na egwu ya na-abụkarị okwu ndụmọdụ,nkụzi nakwa akụkọ ifo. O.nye Ụmụchu n'Anambara steeti,ọ lara mụọ n'afọ 2005. Ụfọdụ egwu o tiri Patty Obasi(1951-2012) Patrick Obasi,onye a ma ama dịka 'Patty Obasi' bụ otu onye na ndị bidoro egwu ụka na Naijiria. Egwu bupụtara nwaafọ Mmakụ(Enugwu Steeti) a bụ efere egwu mbụ ya bụ ""Mama Ịwọta"" nke pụtara n'afọ 1980. Ihe mere egwu Obasi dị iche bụ ụda ya. Njirimara Patty Obasi bụ na egwu ya na-ada nwayọọ nwayọọ, ebe mkpụrụ okwu so ya ga-akpọfeli onye na-ege ya dịka ọ na-ewelite mụọ. Ụfọdụ egwu o tiri Harcourt whyte (1905-1977) Ikoli Harcourt Whyte wepụtara ọtụtụ abụ n'asụsụ Igbo Ikoli Harcourt Whyte bụ onye Abonnema dị na Rivas steeti. Nwa afọ a mụrụ n'afọ 1905Ọ bụ onye nwere maasị n'egwu na ihe egwu site oge ọnọ n'ụlọ akwụkwọ. O butere ọrịa ekpenta n'afọ 1918, ọ bụ ka ọ a kpọgara ya n'ụlọ ọgwụ gọọmenti dị na Pọtakọt ka ya na ndị ekpenta ndị ọzọ gbakọrọ nwee otu egwu Bekee kpọrọ 'Choir'. E mechara buga ya n'ụlọọgwụ 'Uzuakoli Leprosy Hospital', dị na Bende ,Abịa steeti, ebe ọ nọrọ gbakpee ka ọ rịachara ọrịa ahụ afọ iri atọ na anọ. Ikoli Harcourt Whyte's CDs are on sale in Nigeria Egwu e jiri mara nwa afọ bụ 'Atula Egwu' bụ egwu ụfọdụ na-akpọkarị n'ala Igbo ma mmadụ nwụọ. Njirimara Harcourt , onye wepụtara abụ karịrị 200 bụ na ọ naghị e ji ngwa egwu agụ egwu ya. Na-agbanyeghị nke a, egwu ya na-emetụ n'ọkpụkpụ. ma na-agụ akwa mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ egwu o tiri Nnamdi Olebara ( Sir Warrior(1947-1999) Ezi aha 'Sir Warrior' bụ Christogonous Ezebuiro Obinna E jiri 'Sir Warrior mara ya mana ezi aha ya bụ Christogonous Ezebuiro Obinna. Ya bụ nwaamadi bụbu onye ndu otu egwu 'Highlife' wuru na 70s a kpọrọ 'Oriental Brothers.' E mechara otu egwu ahụ gbasaa ụzọ atọ ;Prince Ichita& The Great Oriental Brothers,Oriental Brothers nakwa Sir Warrior &His Oriental Brothers. Oriental Brothers bụ otu egwu bidoro ka Agha Biafra biri n'Owere,Imo Steeti ebe ụmụokorobịa gụnyere Godwin Kabaka,Livinus Akuilo,Fred Ahumaraeze, Ferdimand Emeka Opara nakwa Christogonous Ezebuiro bụ 'Sir Warrior'. Ha nwere nghọtahie banyere etu egwu ha si ada nke mere ka onye bụbu onye ndu ha bụ Godwin Opara dọwara pụọ,bido 'Kabaka'. Livinus na Ichita mechara pụọ,ya afọdụ Warrior,onye kpokọbara ndị egwu ọzọ bido nke ya- Sir Warrior & His Oriental Brothers. Ihe e jiri mara nwoke Mbaise (Imo Steeti)a na egwu ya bụ ụbọakwara na okwu, 'Ọyọrịma' nke a na-ekwu na ọ bụ ya bidoro nakwa okwu miri emi. Ụfọdụ egwu o tiri Akụkọ ndị ga-amasị gị Coronavirus amaghị onye dị ọcha maọbụ ojii." 44171101,https://www.bbc.com/igbo/44171101,Ejizi maka Soshal midia achụ ndị uweojii?,"Mgbe nwaada Ifeoluwa Adegoke, bụ onye ji akara @ife_luv12 na Twitter dere na otu onye uweojii wakporo ya ma yie ya egwu, n'ihi na ọ jụrụ inye ya ego n'agbanyeghị na onye uweojii ahụ kwuru na ọ gaghị ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyeghị ya ego, o mere ihe ndị mmadụ na-emezị ugbua iji hụ na ụwa matara ihe na-eme ha.","Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya. Adegoke dere ihe ndị SARS bụ ngalaba uweojii na-ahụ maka ndị ojiegbe ezu ohi, mere ya ma tinye akara Yomi Shogunle bụ onye uweojii na-ahụ maka ịkwụwa aka ọtọ n'uweojii. End of Twitter post, 1 Ihe o dere wuru ewu ọfụma, ọkachasị mgbe Shogunle zara ya. Emechara nwụchie onye uweojii aha ya dị n'akara ụlọakụ nwaada Ife jiri kwunye ego anaara ya. ACP Shogunle kwuru na ha nwụchịkọrọ Charles Omotosho bụ onye uweojii na-arụ ọrụ n'Ikorodụ, dị na Legọsị, wee wepụ ya n'ọrụ. N'okwu Adegoke, ndi uweojii mere ngwa ngwa hụ na o nwetara ikpe ziri ezi ọsịsọ, kpatara ndị mmadụ ji na-ajụ ma soshal midia ọbuzị ebe a na-ewega ikpe banyere ndị uweojii iji hụ na-emere ihe maka ya? Cheta akụkọ Immanuel James Ibe-Anyanwu, bụ nwaafọ ndị SARS wakporo ka o si n'ụlọakụ apụta. Maazị Ibe-Anyanwu tikwara mkpụ na sosal midi nke mere ndi mmadụ ji gbatara ya ọsọ enyemaka. Gere ihe Immanuel James Ibe-Anyanwu gwara anyi mgbe ihe mere n'elu: Otutụ mmadu na-ekwu na soshal midia bụ ihe ọma, okachasị mgbe ọ na-enye aka n'ụdịrị ihe a. Mana enwere ndị na-akọwa na ihe ọjọọ na-esi soshal midia apụta, nke mere na ndị mmadụ kwesịrị ịkpachara anya ma ha na-eme ihe ha na-eme. Ndị uweojii Naịjirịa so na ndị ụlọọrụ gọọmentị na-apụta na soshal midia ọfuma maka igeta na ime mkaprịtaụka ga-enye aka hụ na ihe kwesịrị ịga etu o kwesịrị. Unyaahụ, ha mere emume ha kpọrọ '#AskThePolice', bụ nke nyere ndị mmadụ ohere ịjụ ha ajụjụ banyere ọrụ ha. Onye sara ajụjụ bụ onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51765251,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765251,Ability in disabililty: 'Ọrụsị m nwere adịghị akwụsị m inwe anụrị' - Nwa nlecha nwere otu aka,Nwanne ọ kwa i nwere aka abụọ ma na-ekwu na ume adịghị gị.,"Ngwa bute oche ka i kirie ka Ziechi bụ ọmalicha nwagbọghọ nwere otu aka si eme karịa gị. Anyị hụrụ ya ebe o ji otu aka ebi ụgụ ma na-emekwa ọtụtụ ihe echeghị na ndị nọ n'ọnọdụ ahụ ga-emeli. Kirie ya n'uju ebe a. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo, Ebere Ekeokpara na Chimamaka Ihenacho Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42845898,https://www.bbc.com/igbo/42845898,Ndị Taliban egbuola mmadụ 95 na Afghanistan,Otu onye ogbunigwe mgbagbuonwe egbuola ihe ruru mmadụ iri itoolu na ise ebe ihe karịrị otu narị na iri ise na asatọ ndị ọzọ meruru ahụ n'agha ndị Taliban buru n'etiti isi obodo Afghan bụ Kabul dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu si kwuo.,"Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwere ike itinye dịka ndị nyocha siri kwuo Ndị mere ihe a bu ụgbọalaozu ha kpojuru ngwoagha ogbunigwe gafe ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala banye otu ụzọ ebe nanị ndị ọrụ gọọmentị na-aga. Ihe a mere n'akụkọ otu ụlọ mịnịstrị gọọmentị etiti Afghan mere ochie dịkwa n'akụkụ ụlọ ọrụ ndị otu EU. Ndị Taliban ekwuola na ha buru agha ahụ nke kachasị njọ n'ọnwa gara aga. N'otu izuụka gara aga, ndị Taliban gburu mmadụ iri abụọ na abụọ n'ụlọ nkwari dị na Kabul. Ndị hụrụ ka ihe a mere kwuru na ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ kachasị ndị bịara abịa nọ n'ebe ahụ tupu ogbunigwe ahụ agba taa. Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ndị mmadụ nwekwara ike ịnwụ ọzọ dịka a ka na-ebute ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọọgwụ." afirika-48558479,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48558479,"NUJ, NGE, Media Rights akatọọla mmachi a machiri AIT na Raypower",Otu jịkọtara ndị ntaakụkọ na Naijiria nke a kpọrọ NUJ n'aha ịchafụ na nke jikọrọ ndị isi ụlọ ntaakụkọ (Nigeria Guild of Editors) na ụlọọrụ ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị ndị ọrụ ntaakụkọ bụ Media Agenda akpọọla okwu aha.,"Ha akatọọla mmachi a machiri ụlọọrụ ntaakụkọ DAAR Communications bụ ndị nwe Africa Independent Television (AIT) nakwa Raypower FM. Ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ikuku bụ National Broadcasting Commission(NBC) napụrụ AIT na Raypower ikike mgbasaozi ha n'ụbọchị Tọọzdee n'ihi ihe ha kpọrọ ""nnupu isi n'iwu mgbasaozi."" Mana onyeisi otu NUJ bu Christopher Isinguzo gwara BBC Igbo na mmachi a machiri AIT na Raypower megidere iwu nnwereonwe nke ndị ntaakụkọ nke Bekee kpọrọ, 'Press Freedom'. Isinguzo kwuru na ọ bụrụgodu na ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ dara iwu dika NBC si bo ha n'ebubo, ọ dị ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi taa ha ahụhụ karịa ị napụ ha ikike ha ji arụ ọrụ ma ọbụ mechie ụlọọrụ ha. Otu n'me ụzọ ndia gụnyere ime ka ha kwụọ nnukwu ụgwọ. Onyeisi otu NUJ ahụ kwukwara na ọ ga-amagbu onwe ya ma NBC nyeghachi AIT na Raypower ikikere mgbasaozi ha ma werezie nwayọọ chọwa otu ha ga-esi taa ụlọọrụ ahụ ahụhụ ma ọbụrụ na ha dara iwu n'ezie. Raymond Dokpesi bụ onye nwe Daar Co mmunication, ụlọọrụ nwe AIT na Raypower N'otu aka ahụ, otu Nigeria Guild of Editors katọkwara mmachi ahụ NBC machiri AIT na Raypower. Onyeisi otu ahu bu Funke Egbemode rịọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka o were ikikere ya dịka onyeisiala wee nye iwu ka NBC nyeghachi ụlọọrụ DAAR ikike mgbasaozi ha. Ọzọkwa, Edetaen Ojo bu onyeisi otu Media Rights Agenda kwukwara na NBC emeteghi ya ịnara AIT na Raypower ikike mgbasa ozi ha. Ojo gwara BBC Igbo na NBC abụghị iwu n'aka onwe ya nke na ha ga-abụ onye mkpesa bụrụkwa onye ọkaikpe n'okwu ahụ. Ọ sịrị: ""Anyi agaghi egbu oge ịkpụpụ NBC n'ụlọ ikpe ma ọbụrụ na ha enyeghachighi AIT na Raypower ikike mgbasaozi ha."" Ishaq Modibbo Kawu, onyeisi National Broadcasting Commission (NBC) Ebubo NBC boro DAAR Communication gunyere na ji emume onyoonyoo ha nke a kpọrọ 'Kaakaki Social' agbasa ozi nwere ike ibute iwe nakwa ọgbaaghara n'obodo. Onye nọ n'isi oche NBC bụ Ishaq Modibbo Kawu kwuru na ha adọọla ụlọọrụ DAAR aka na ntị uboro ugboro ka ha kpachara iche etu ha si eji ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia were agbasa ozi na onyoonyoo tiivii mana aka na ntị nile ndị ahụ dara n'aja. Ụlọọrụ DAAR n'aka nke ha gọrọ na onweghi iwu ọbụla ha dara kama na NBC ma ụma agụ nwa nkịta ajọ aha iji wee kugbuo ya. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-49984169,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984169,NYSC Camp: Ndị ji asambodo adịgboroja akarịala - NYSC,Anyị nwụchiri ndị ji asambodo adigboroja - NYSC,"Akụkọ dị mkpa: Ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC sị ha nwụchiela ụmụakwụkwọ dị iri itoolu na ise ji asabodo adịgboroja bịara ife ala nna ha. Onyeisi NYSC bụ Brigadier General Shaibu Ibrahim kwuru nke na wednezde n'oge ọmụmụ ihe ịnabata ndị agba ọ hụrụ. Ọ sị na mmadụ iri isii na ise n'ime ha sị na mahadum ndị nọ na Naịjirịa ebe iri atọ si na madahum na-anọghị na Naịjirịa. Ọ kwara arịrị maka etu ịkpụ asamboso adịgboroja si arị ibe ya elu na Naịjirịa na ọ bụ n'ihi nke a mere ha ji hiwe ọmụmụ ihe a. Atụmatụ ga-emegide idina ụmụakwụkwọ na Madadum Ndị ụlọomeiwu etinyela atụmatụ iwu ga-egbochi ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha na mahadum . N'ozi osote onyeisi ndị Sịnetị bụ Ovie Omo-Agege kwuru na nyocha ọhụrụ a BBC wepụtara ga-enye aka ịkwalite ime ga atụmatụ a bụrụ iwu na Naịjirịa. a gụpụtara iwu n'ụlọomeiwu na Wednezde, ọ bụrụ na e mee ya dịka iwu, ọ ga-ara onye nkuzi ahụ ịchọ idina nwata akwụkwọ. Bọjetị a bụ nke ụtụ isi - Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu akatọọla akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2020 ma kwuo na ọ bụ bọjetị ụtụ isi. Cheta na onyeisiala Buhari gụpụtara akwụkwọ mkpata na mmefu a ọ kpọrọ bọjetị maka mwulite akụnaụba na ọrụ n'ihu ndị ụlọomeiwu ụnyaahụ. Ndị omeiwu Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-agba mbọ ihụ na ha mechara nnyocha atụmatụ nweta na mmefu ego maka afọ 2020 tupu ọnwa Nọvemba agwụ. Benjamin Kalu bụ ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta gwara ndị ntaakụkọ nke a na ụnyaahụ. O kwuru na ha ga-agbalị ịhụ na Bọjetị nke afọ 2020 malitere n'ọnwa Janụwarị kpọmkwem. N'okwu ya, ụlọomeiwu ahụ ewepụtala abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba ruo abali ise nke ọnwa Nọvemba maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ịbịa kọwaa etu ha ga-esi mefuo ego n'afọ 2020. ""Anyị agaghị anabata ngalaba ọbụla na-abịaghị kọwaa bọjetị ha ma Nọvemba 5 gachaa."" ""Nọvemba 6 ka anyị ga-amalite ikpokọta nakwa ịhazi bọjetị ngalaba dị icheiche ruo Nọvemba 27."" ""Anyị na-atụ anya na anyị ga-emecha ihe niile gbasara Bọjetị 2020 na Nọvemba 28."" Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara Bojetị 2020 n'ụbọchị Tuzde, abalị itolu nke ọnwa Nọvemba. Bọjetị ahụ gosiri na Naịjirịa ga-emefu ego dị tarị naịra iri na ụma atọ na atọ n'afọ na-abịa abịa. Na Turkey Ụgbọelu agha ndị Turkey agbala ogbunigwe na mpaghara ugwu mba Syria n'ihe iwe bụ nke nwereike ibute agha n'etiti ha na ndị agha nnupuisi Kurdish. Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan sị na nke a bụ iji chụsaa ndị agha Kurdish ma mee ka nchekwa dị n'ogige ahụ. N'egwuregwu William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Gịnị ka ị ma gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị? N'Amerịka Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump Ụlọọrụ onyeisiala Donald Trump ekwuola na ha agaghị akwado nnyocha nke ndị omeiwu mba ahụ na-enyocha onyeisiala iji chutuo ya n'ọkwa. Ha kwuru na nnyocha ahụ enweghi isi na ọdụ bịa bụrụkwa ihe na-adabaghị n'iwu mba Amerịka. N'egwuregwu Tammy Abraham Ndị otu egwu bọọlụ mba Ịngland ekwekọrịtala na ha agaghị anabatazi ịkọ ọnụ agbụrụ n'asọmpị ha na-agba iji tozuo isonye n'egwuregwu Euro 2020 Tammy Abraham gwara ndị ntaakụkọ na ha kwekọrịtara na ha ga-akwụsị ịgba bọọlụ ma si n'ama egwuregwu pụọ. Mba Ịngaland ga-ezute ndị Chek Rịpọblik n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ma zutekwa Bulgeria ụbọchị Mọnde, abalị iri na anọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ" media-53985674,https://www.bbc.com/igbo/media-53985674,"Nwa afọ Igbo a arụpụtala igwe ọkụ latrik ọkụ anyụ anyụ anaghị eji mmanụ, ikuku maọbụ mmiri",Kamgbe afọ 2006 ka Christopher Okoye malitere irụpụta igwe ọkụ na anaghị eji mmanụ ma anyanwụ arụ ọrụ.,"O kwuru na igwe a ga-enyeli ndị mmadụ ọkụ latrịk akwụsị akwụsị, O kwuru na ugbua ọ na-akwado imepe ụlọọrụ ka o nweike ịnata nzere. Okoye kwuru na ọ na-eme nke a iji belata nsogbu mgbanwe ihu eligwe na-ebute ma ji ya rụpụta ụgbọala eletrik." afirika-46862734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46862734,Onnoghen: Ihe mere ụlọikpe ji kwụsị ikpe ya na CCT,Egwu ọ dagharịala n'okwu mkpụpụ Walter Onnoghen?,"Ụlọikpe ukwu dị n'Abụja bụ nke ọkaikpe N.E Maha nọ n'isi ya, enyeela iwu ka gọọmentị etiti sepu aka n'ịkpọpụ ọkaikpe Onnoghen n'ụlọikpe rue abalị iri na asaa nke ọnwa Jenụwarị. Cheta na Onnoghen abịaghị na CCT taa mgbe a kpọpụtara ikpe ya na CCT ụbọchị Jenụwarị iri abụọ na abụọ. E bidoro ya bụ ikpe mana ahụghị Onnoghen n'ụlọikpe. Ndị ọkaiwu na-ekwuchitere Onnoghen ọnụ ka na-ekwusi ike na ụlọikpe eweghị ikike ịma Onnoghen ikpe. Cheta na eboro Onnoghen ebubo mpụ ekwuputeghị ihe ole na ole onwere ma mepekwa ọba ego mba ofesi. Eyighariala ya bụ ikpe ruo abali tusde nke ọnwa Jenụwarị iri abụọ na abụọ. Ndị ọkaiwu anọrola n'oche. Ndị ọnụ nkpechita nọkwa ya. Akụkọ na-eru anyị nti kwuru na ọtụtụ ndị SAN biara ya bụ ikpe. Ndị gbara akwụkwọ kwụkwa chim na-eche. A na-eche ka ikpe bido. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53104212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53104212,World Sickle Cell Day: Ihe mere m ji enyere ndị bu ọrịa 'Sickle cell' aka,"Maureen Nchekwube bụ otu nwagbọghọ, onye ya na ụmụnne ya abụọ rịara ọrịa 'sickle cell' akọwala ihe ha gabigara nke mere ha ji enyere ndị bu ọrịa a aka ugbua.","Ọ sị na mgbe ọ gara Mahadum ka ọ chọpụtara na ọtụtụ mmadụ amaghị ihe gbasara ọrịa nke ọma, na ọ bụ ebe ahụ ka ọ malitere ikuziri ndị mmadụ ihe banyere ya. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ o kpebiri na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-arụ ma ọ bụghị ị na-enyere ndị bu ọrịa 'sickle cell' aka etu ha ga-esi chekwaa ndụ ha. Nchekwube sị ihe ọzọ ha na-eme bụ ịkwado ụfọdụ n'ime ndị na-enyeghi ego ha ji aga ụlọọgwụ site n'inye ha ọgwụ. O nyekwara ndụmọdụ sị tupu nwoke na nwaanyị ana-alụ onwe ha gbalịa gaa ụlọọgwụ mee nyocha ahụ a kpọrọ 'Genotype' ka nwee ike gbanarị ọghọm dị n'ịmụta nwata bu ọrịa 'sickle cell'. Kirie ihe o kwuru n'uju. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51132423,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132423,"Biafra at 50: 'Anyị chere na anyị bịara ịnabata ndị enyi, anyị amaghị na ọ bụ ọnwụ ka anyị na-agakwu' - Onye hụrụ 'Asaba Massacre'","Ọ kọwara ebe dị icheiche e gburu ndị mmadụ n'igwe, n'ụbọchị ahụ.","Obi Amuwa gwakwara BBC Igbo etu ebe ato egbukwara ọtụtụ mmadụ n'Asaba. Ọ gwakwara BBC Igbo na na-agbanyeghị mberede njọ ahụ, ụmụ nwaanyị Asaba merchara lụọ ọtụtụ ndị ugwu, wee bụrụkwa nwunye onyeisi Naịjịrịa. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chris Sanctus Okereke, Chiemela Peters, Ebere Ekeopara na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45319235,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319235,Trump o sị na ndụ afọghị n'ime Buhari?,"Agbanyeghị na ọ bụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ bịa n'Amerịka, ụlọ ntaakụkọ Financial Times edeela na Trump katọrọ Buhari ka ha mechara nzụkọ.","Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe Financial Times, n'akụkọ ha dere maka nzukọ Trump na onyeisiala Kenya bụ Uhuru Kenyatta na Trump ga-enwe n'izu a, sị na Trump gwara ndị ọrụ ya na ya achọghị ka ya na-ụdịrị mmadụ a nwe nzụkọ ọzọ, maka na ọ hụru Buhari ka ""onye ndụ adịghị n'ahụ"". Ụlọ ntaakụkọ a kwuru na ọ bụ ndị nọ mgbe ihe a mere gwara ha ihe Trump Kwuru banyere Buharị. Buhari bụ onyeisiala mbụ si mpaghara ndịda Afrịka ya na Trump zutere. Nzukọ a mere n'ọnwa Eprelu nke ọnwa. Trump na Kenyatta ga-ezute taa ịkpa nkata maka azụmahịa na nchekwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45769612,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45769612,Delta state: Lee ka ndi Igbuzo si nwete ala ha,Akụkọ gboo kowara na ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Umejie bụ onye mụpụtara Igbuzo.,"Umejie bụ nwa eze Isu n’ime Anambra steeti, mana maka na o gburu mmadụ, nna ya achụọ ya na yabụ ala. Mana nna Umejie bunyere ya otu ite ọgwụ, ọ gwara ya na ebe ọbụla ite a dara n’ala ka ọ ga-ebi. Ọ bụ ala a ka ite a dara. Ihe nkiri a gosiri ihe di iche iche onye ntaakukọ BBC Igbo hụrụ n'Igbuzo." afirika-45964985,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45964985,Rochas Okorocha: 'Ọ bụ sọ ọgọ m Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC',Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ,"""O nweghi onye ọzọ ka Uche Nwosu mma"" - Okorocha Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ sọ ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC. O kwuru nke a dịka otu ụlọịkpe n'Abuja mapụrụ ikpe dị n'etịtị Uche Nwosu na Hope Uzodinma bụ ndị abụọ meriri ntụlịka imeụlọ n'Imo iji zọọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC. Victor Umeh, onye meriri ntuliaka Sineti ndị Anambra ebe mpaghara Etiti nke e mere n'ụbọchị 16 Jenụwarị, 2018 Victor Umeh bụ sinetọ nọchitere anya Anambra Central agwaala onyeisiala bụ Muhammdu Buhari ya gbaa mbọ tinye aha onye Igbo si n'ọwụwa anyanwụ n'ime aha ndị ewpụtara maka ndị ga-eso na National Defence Council nakwa National Security council iji gosi nhatanha. Mba Amerịka akagbuola akwụkwọ ikike ịbata ala ha nke ha nyere mmadụ iri abụọ n'otu bụ ndị mba Saudi Arabia echere na aka ha dị n'ogbugbu Jahmal Khasoggi Onyeisiala ahụ bụ Donald Trump kwukwara na mkpuchi ọnwụ Khasoggi bụ nke kachasị njọ kemgbe oge bidoro. Onye nkuzi otu Manchester United bụ Jose Mourinho ekwuola na otu Juventus abụghị ọgbọ ndị Manchester United n'ihe gbasara egwuregwu. O kwuru nke a mgbe Juventus ji otu ọkpụ merie Man U mgbe ha zutere na Old Trafford. Akụkọ dị mkpa taa Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo akpọkuola ụmụ nne ha ndị IPOB ka ha bịa ka e mee udo maka ọdị mma ndị Igbo na mwulite mpaghara ọwụwanyanwụ. Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ha bụ KingsKingsley Dozie kwuru na ọ ga-aghọ ndị Igbo ahịa ma ọ bụrụ na ha e sonyeghi na ntuliaka afọ 2019. Ọgbaghara Zamfara Steeti Nsogbu ndị ozuu ehi atala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Zamfara steeti E gbuola ọtụtụ ndị mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'ime ọgbaghara dapụtara n'etiti obodo Lafiya na Boshikiri nke Adamawa Steeti. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Abubakar Othman kwuru na ọ nụghị maka onye ọbụla e gburu kama ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua. N'ofesi Ndị a na-amaghị ndị ha bụ zigara ozi ogbunigwe n'ụlọ onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Barack Obama nakwa onye bụbu odeakwụkwọ mba ahụ bụ Hillary Clinton. Ndị ọrụ nchekwa Secret Service kwuru na ha gbochiri ozi ndị a n'ụzọ tupu o rue ebe e zigara ha. N'egwuregwu Asọmpi Uefa Champions bụ nke jịkọtara otu egwuregwu bọọlụ dị na mba ndị Europe nille. N'abalịa Barcelona na Intermilan ga-achịpụ ya n'asọmpi Uefa Champịọns, ebe Dortmund na Atletico Madrid ga-ezute ibe ha. Liverpool, Tottenham, Monaco, Napoli, FC Porto, na ndị ọzọ ga-anọkwa n'egwu. Nkeji abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke abalịa Hyperrealism: 'A na m ese ihe maka ndụ ndị nnanna anyị' Gee Nkeji nke ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49641374,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49641374,'Onweghị onye chụpụrụ Orji Kalu n'ọrụ' - APC,Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke APC dị n'Arọchukwu ekwuola na ụlọikpe ehibere n'Ụmuahia maka mkpesa gbasara ntuliaka achụpụghị Orji Kalu n'oche ya dịka omeiwu nke 'Abia North'.,"Ha kwu kwara na ha anabataghị mkpebi ụlọikpe ahụ. Ha gara n'ihu kwuo na Ọrji Kalu bụ onye ama ama nwetere ntuliaka puku iri atọ, narị abụo na atọ were meria onye nke otu PDP bụ Mao Ohuabunwa nwetere puku iri abụo, narị asatọ na otụ. Otu APC kwuru na ha ga-eweghachị ikike enyere Ọrji kalu n'ụloikpe mkpesa. Ma kọwakwaa na ụlọikpe ahu nyere iwu ka emegharịa ntụliaka n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka nke dị na 'Abia North'. Ha riọkwara ka ndị otu APC niile dere ma hapụ ka ndị ọzọ tinye ha n'ikpa agwa ọjọọ ma kwu kwaa ka ndị PDP na ndi enyi ha kwụsị igbasa ozi asi maka Orji kalu. N'aka nke ọzo ụlọikpe nyere iwu na Kalu nwereike ịkpeasa ya bụ ikpe mgbe abalị iri itoolu gachara. Lee akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri ga-amasi gị Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo" afirika-43258940,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43258940,Ougadougou: a na-awakpo isi obodo Burkina Faso,Ndị na-ekwu sị na a na-anụ ụda egbe na ụda ogbuniwge n'isi obodo mba Burkina Faso bụ Ougadougou.,"A wakpola Burkina Faso mbụ n'afọ 2016 Agbara ogbunigwe a n'isi ụlọọrụ ndị agha Burkina Faso ahụ egbe ndị hụrụ ihe na-ekwu na ndị bu egbe sị n'ịme ụgbọ ala ritue na-eti 'Allahu Akbar!' Ndị a malitere ị gba ndị mmadụ egbe tupu ha a ga n'ụlọ nnọchite nke mba France dị n'obodo ahụ bido mwakpo ha. Ndị agha na ndị nche n'ebe ahụ na buso ndị ahụ bu egbe agha ka akụkọ na-ekwu. Amabeghị ndị bidoro mwakpo a, maọbụ ihe bụ uche ha. Akụkọ ka na-abịa." afirika-46984301,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46984301,Nigeria Elections 2019: Nwoke akụpụla nwunye ya eze maka ọ chọrọ Buhari,Otu nwoke aha ya bụ Abdullahi Yadau chụrụ nwunye ya makana ọ sị na o geghi ya ntị mgbe ọ gwara ya kwụsị ịkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari.,"Tupu nwoke a achụọ ya bụ nwaanyi, o tiri ya ihe, ma kụpụ ya eze. Abdullahi gwara BBC na ya adịghị alụzị nwunye ya bụ Hafsat Suleiman ka ọ gwara ya na ""ọ bụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ ga-atunyere na ntuliaka 2019."" Ọ sị na o buru okwu a gakwuru nne na nna nwaanyị, bu ebe okwu no banye ọgụ mere o ji kụpụ ya eze. BBC gbara mbọ nweta olu Hafsat, mana ndị be ya sọ na ọ nọghị n'ọnọdụ ikwu okwu. Mana, nwanne ya nwoke bụ Ibrahim Suleiman kwuru na ihe a mere n'eziokwu. Ibrahim sị na nwanne ya ""agaghị alaghachi be Yadau ọzọ."" Ma kwukwa n'ihe bụzị ezigbote nsogbu n'etiti ezinaulọ ha nakwa nke Yadau." 42867459,https://www.bbc.com/igbo/42867459,Ozu Alex Ekwueme anatala Naịjirịa,Akụkọ na-apụta kwuru na ebụnatara ozu ya n'ụtụtụ ụnyaahụ n'Abuja.,Ekwụeme bụ onyeamama na ndọrọndọrọ ọchịchị na ala Naịjirịa E bidoro mmemme a ga eji kwa ozu ya n'ụbọchị orie bụ abalị 19 Jenụwarị. A ga akwanyere Ekwụeme ugwu n'ebe a na-akpọ Ọkpara Square n'Enugu ebe elekere anọ ehihie taa tupu ebula ya n'obodo ya bụ Oko na Anambara steeti. Ekwueme nwụrụ n'ụlọọgwụ na London n'ụbọchị eke 19 Novemba 2017 afọ gara-aga. afirika-51765247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765247,Abaribe: 'O nweghị otu mkpụrụ ihe a ga-eji ego mbite a rụọ n'ala ndị Igbo',Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na omeiwu Enyinnaya Abaribe katọrọ usoro ndị ụlọomeiwu ukwu ji kwenye ka gọọmenti etiti bite ego ruru ijeri dọla iri abụọ na abụọ.,Ihe Abaribe kwuru maka mbibi $22.7m Kamgbe ahụ ndị mmadụ na-eto ya n'elu soshal midia. Abaribe kwusiri ike na ụfọdụ ihe e depụtara bụ ihe kpatara gọọmenti ji ebi ego ahụ adabachaghị ọfụma ma na-ekwu na ọ karị dị mma ọ bụrụ na emere ntụliaka n'ụlọomeiwu gbasara ya. Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru n'elu soshal midia @mrintergrity kwuru na Enyinnaya Abaribe mere ọfụma n'etu o si kwupụta uche ya. @frediecruze tokwara Abaribe. Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-53454652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53454652,Nnamdi Kanu: 'Onye isi ndị IPOB amaghị nke bụ eziokwu ihe mere n'Oba',"Dịka onyeisi otu ""Indigenous Peoples of Biafra"" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu kpọrọ ndị na-achị Oba aha ma si na ọ bụ ha ka ọ na-ejide maka mwakpo a wakporo ndị otu ya ebe ha na-eme nzukọ, onyeisi ndị okorọbịa n'Oba ekwuola etu okwu ahụ sị malite.","Ikechukwu Ezeukwu, onye bụ ""President General for Youths"" n'Oba gwara BBC Igbo na ya anaghị ata Nnamdi Kanu ụta maka etu o ji Jiri iwe kpọọ ndi Oba iyi ụbọchị Wenesde. Ọ sị: ""Ọ bụ ihe a gwara ya, na etu e si gwa ya kpatara oji kwuo ihe o kwuru."" Ọ gakwara n'ihu sị na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị otu nzuzo kpatara okwu a. ""Ọ bụ onye magburu mmadụ ka ndị okorọbịa chụụrụ ọsọ banye ebe ndị Ipob na-eme nzukọ."" Ọ si na ndị okorobịa na-achụ onye gburu mmadụ ọsọ gwara ndị Ipob ka ha kpụpụta onye ahụ ha na-achọ mana ha ekweghị. Dịka Ezeukwu si kọwa, ọ bụ ka a na-adọ ndọrọndọrọ ka onye ahụ gburu ọchụ nwetere ohere gbaa ọsọ, nke butere iwe ndị okorọbịa kpatara ihe ahụ mere. Ọ kowara ọtụtụ ihe ndi ọzọ ị ga-anụ ma i gee ihe o kwuru." afirika-46129280,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46129280,Minimum wage: Ọ ga-ebute 'inflation'?,"Ihe ọtụtụ ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba obodo - bụ ndị Bekee kpọrọ economists - na-ekwu banyere okwu ịtụnye ndị ọrụ oyibo azụ dịka ndị NLC na gọọmentị na-akpa, bụ na ọ ga-ebute ihe Bekee kpọrọ ""Inflation"".","""Inflation"" a pụtara na ihe ga-ebido ịda oke ọnụ ahịa. Ihe a ha na-arụtụ aka sitere n'ihe meburu mbụ mgbe e tinyere ego n'ụgwọ ọnwa. Kedụ ihe bụ""Udoji Award""? Jerome Udoji bụ onyeisi ngalaba Ọchịagha Yakubu Gowon, hibere ya maka nhaziagharị ọrụ oyibo na Naịjirịa n'afọ 1972. Ngalaba a nyere gọọmentị etiti mgbe ahụ ndụmọdụ ka o tinye ego n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ n'afọ 1974. Ego e tinyere mgbe ahụ butere ntinye ego na ngwaahịa ruru pasentị 34 n'afọ 1975. Kemgbe onyinye Udoji a, gọọmentị etinyela ego n'ụgwọ ọnwa ugboro ugboro. Ntinye ego ndị a na-ebutekwa ntinye ego na ngwaahịa. Ugbua, dịka gọọmentị Muhammadu Buhari kwuru na ha ga-etinye uche ma mara ma ha ga-enye ndị ọrụ puku naira iri atọ ha sị na ha chọrọ, BBC jụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ihe metụtara akụnaụba ma ""inflation"" ọ ga-abịa ọrịrị. Devo Okorie kwuru sị ""n'ezie, mbuli ụgwọ opekatampe ga-ebute 'inflation', makana ihe ọ pụtara bụ na etu onye na-eri ụgwọ ọnwa na-esi emefu ego ga-agbagote karịa etu ọ dị na mbụ. ""Ndị na-ere ihe ga-ebuli ego ihe ha na-ere makana ha na-ahụta ya na ego ndị mmadụ na-eritezi agbagotela. ""Ọ dị ka onye na-arụrụ onwe ya ọrụ zụrụ ụgbọala ọhụrụ, ọtụtụ oge, onye nwe ụlọ o bi na ya ebuliere ya ụgwọ ụlọ, makana ọ na-ahụta ya na o nwere ego mmefu. ""Mana ọ bụrụ na gọọmentị bulie ụgwọ ọnwa, ma mekwaa ka ọrụ dị icheiche dịrị n'obodo. Ihe ọ ga-eme bụ na ọ na-emelite etu ego si agbasa n'obodo nke Bekee kpọrọ 'cash flow', nke kwesịrị ime ka inflation a gbadata."" Akụkọ ga-amasị gị" 43715739,https://www.bbc.com/igbo/43715739,Lee ngwaagha ndị uweojii Naịjirịa napụtara ndị mmadụ,"N'ọnwa Febụwarị onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nyere ndị kọmishịọna ndị uweojii Steeti niile iwu ka ha kpachie egbe, mgbọ nakwa ngwaagha nke dị n'aka ndị nchekwa ọdịnaala, ndị na-achị ehi, ndị ọrụ ubi na ndị nille na-eji ngwagha n'ụzọ na-ezighị ezi.","Jimoh Moshood dịka ọ na-egosị ngwaagha ndị akpachiri N'ihi nke a, ndị ọrụ ọtawaike nke ndị uweojii hiwara malitere ọrụ n'ịchịkọta, ịkpachị nakwa nweghachị ngwaagha, egbe na mgbọ nke dị n'aka ndị na-ekwesighị ekwesi gụnyere ndị omeka ome. Ha mere nke a site na i nyocha, na nzaacha ebe nzuzo dị icheiche e zoro ngwaagha ndị ahụ site n'akụkọ kepukepu ha nụrụ. Ngwaagha ndị kpachiri: Ngwaagha niile a dị narị anọ na iri abụọ na ise, agbanyeghị na-agbatị kwuola ohere enyere ndị mmadụ ịwụsa ngwaagha ha n'aka ndị uweojii rue ụbọchị iri abụọ na otu. E hịwara mkpachị na mkpochapụ ngwaagha ndị a iji nyere ndị uweojii aka igbochi ọgụ dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ubi, ntọọrọ mmadụ, izu ohi, iyi ndụ egwu na ihe ndịọzọ. Mgbọ egbe dị icheiche so na ngwaagha ndị akpachiri Dịka ọ ka na-aga n'ihu, ndị uweojii agwala ndị mmadụ ka ha mee ka ndị uweojii mara maka onye ọ bụla ji ngwaagha n'ụzọ na-ezighiezi nke megidere iwu 'Firearms Act'. ""Ndị uweojii a naghị ala azụ na nkwa ha ichekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ na Naịjirịa"" Jimoh Moshood bụ onye na-ahụ maka mmerikọta ndị uweojii na ndị ọdịnala kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43327148,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43327148,#IWD: NAWOJ ekwuola ka e buso omenaala na-akpagbu ụmụnwaanyị agha,"Dịka a na-eme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị n'ụwa niile taa, otu jịkọrọ ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ nke a kpọrọ NAWOJ n'aha ịchafụ akpọọla oku ka e tinye uchu na mbọ a na-agba iji kwusi omenaala na-emegide ụmụnwaanyị.","N'akwụkwọ ozi nke osote onyeisi NAWOJ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Chibota Edozie tinyere aka, o kwuru na e nwela ọganihu na mbọ a na-agba ikwụsị omenaala na-emegide ụmụnwaanyị mana ọ dị mkpa ga-etinye uchu ime ka ọ kwụsị mkamkpam. Ọ sịrị: ""Kemgbe, ala anyị dịka omenaala Igbo siri di, anaghị enye ụmụnwaanyị oke dịrị ha na ohere iji zipụta osinachi ha nwere. ""Mana ọ bụ ihe na-akwalite ume na site na mbọ ọtụtụ otu dịka NAWOJ na-agba, ihe gbasara omenaala na-emegbu ụmụnwaanyị."" Ọ gara n'ihu kwuo, ""Dịka anyị na-eme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị taa, ana m akpọ ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ nọ n' ọwụwa-anyanwụ oku ka ha kwusie ike n'ịgba mbọ ka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụnwoke hata nha."" Edozie kwere nkwa na otu ha-agaghị ezu ike rue mgbe iji omenaala emegbu ụmụnwanyị ga-abịa na njedebe." afirika-45186252,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45186252,Guaranty Trust Bank: Ihe mere e ji gbachie ụlọọrụ anyị,Oyinade Ogunade bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi nke ụlọọrụ 'Guaranty Trust Bank' gwara BBC Igbo ihe mere ndị ụlọọrụ ụtụisi ji gbachie ụlọọrụ ha dị n'Enugwu.,"End of Twitter post, 1 O kwuru na ndị ụlọ ụtụisi ajụghị ha ese maka akwụkwọ ụtụisi ha gosiri na ha ejighị ụgwọ tupu ha agbachie ụlọọrụ ha ahụ. O kwukwara na ha na-elebanye anya na ya bụ ihe ma marakwa ihe ha ga-eme maka ya n'ebe ndị ụtụisị nọ. Akụkọ si n'akara Twitter @EnuguCoal_City kwuru na ndị ụlọọrụ ụtụisi dị n'Enugwu steeti gbachiri ụlọọrụ ndị GTB nakwa nke Sterling nọ na steeti ahụ maka ụgwọ ụtụisi ha ji gọọmentị ka ha natachara ikike ụlọikpe. Anambra: Onye na-ezu gọọmentị ohi ga-aga mkpọrọ Mana mgbe BBC kpọrọ ndị ụlọọrụ ụtụisi nke dị n'Enugwu steeti ahụ n'ekwentị ịjụta ha gbasara mgbachi a ha mere, enweghị onye zara ekwentị ha. Anyị ka ga na-akpọ ha ịnụta ihe ha nwere ikwu gbasara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45843803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45843803,Akụkọ dị mkpa taa: Pope Francis eyipụla mmadụ abụọ uwe fada,Pope Francis ekpebiela maka fada abụọ,"Onyeisi ndị otu ụka katolik bụ Pope Francis eyipuola mmadụ abụọ sị mba Chile uwe fada maka ebubo nwakpo ụmụaka. Pope Francis kwuru na ha ka na-enyocha ọtụtụ fada ndị ọzọ tinyere aka nudi emume a. Buhari emeela mkpebi ọhụrụ Gọmenti etiti ekwuola na ha ebidoola ịnyocha ndị Naijiria bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ruru iri ise maka emume gbasara mpu na aghụghọ. Ọ bụ onye mgbasa ozi gọọmenti a bụ Garba Shehu zipuru ozi a mana o nweghị aha ọbụla ọkpọrọ n'ime yabụ akwụkwọ ozi. N'egwuregwu Onye bubu onye ọgba bọọlu otu Arsenal bụ Thierry Henry nke ayị na-akpọ Igwe abuola onye nchikọta otu bọọlụ n'obodo Monaco. Henry binyere aka n'akwụkwọ kwuru na ọ ga-abụ onye nchịkọta ha ruo afọ 2021. Gee nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọkụ agbagbuola ụmụ mmadụ n'Abịa steeti Ọkụ si na okporo mmanụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri n'itoolu n'Abịa steeti mgbe ụfọdụ ndị ntorobia gara ohi mmanụ agbidi ebe ahụ. Onye ọrụ ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ NNPC akpọrọ Ndu Ughamadu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'ime obodo Umudaru. Na ndọrọndọrọ Otu PDP ekwuola na ihe ha jị họrọ Peter Obi dịka onye ga-eso Atiku zọ ọkwa onyeisiala abụghị maka na o si na mpaghara ọwụwa anywanwụ Ha kwuru na o zuru oke n'ihe niile a na-achọ n'ime onye ga-abụ osote onyeisiala. Akụkọ Teknụzụ, Ọ bụrụ na ịnwere akara Facebook oge eruola iji gbanwe passwordu gị Maka gịnị? N'ihi na Facebook ekwuola na ndị na-eji ụzọ ezihi ezi abanye akara ndị mmadụ awakpoola akara ruru nde iri abụọ n'itoolu. N'Egwuregwu, Otu egwuregwu mba Libya ruru mmadụ iri ise atụọla n'Uyo dịka ha na akwado ịzute otu super eagles n'ụbọchị satọde. Nzute ahụ ga-egosi onye tozuru ịga asọmpị Afrịca cup of Nations n'afọ 2019." 45172296,https://www.bbc.com/igbo/45172296,Ụlọọrụ onyeisiala: Mmeri APC gosịrị na Buhari na Osinbajo ịzọkọ na 2019 ga-eme nke ọma,"Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ọ bụrụ na Muhammadu Buhari na osote ya bụkwa onye nke na-arụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osibanjo zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, na ha ga-eme nke ọma.","Buhari na Osinbajo zọkọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2015 Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Garba Shehu kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Aso Rock taa bụ Monde. Garba kwuru na mmeri otu pati APC mere na ntuliaka ndị omeiwu e mere na steeti atọ na-egosi na mmeri bụ nke Buhari na Osinbajo n'afọ 2019. ""Ntuliaka kwuru utuliaka, ndị Naijiria na0egosi ntuụkwasị obi ha nwere na Buhari na Osinbanjo. ""Ntuliaka ọbụla na ndị a kajar akaja. maka na o o nweghị nke bụ obere n'ime ha. ""Obi dị anyị ụtọ na anyị meriri."" Ọ gara n'ihu kwuo na ""Mmeri ndị a na-egosi na Buhari/Osinbajo ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ ọzọ ga-eme nke ọma."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53872652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53872652,Mwakpo Ekweremadu: Ikpe mmadụ abụọ 'so wakpoo' Ekweremadu ga-abụ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba 2020,"Miriam Knetzger bụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọikpe dị na Nuremberg (nke Bekee kpọrọ ""Nürnberg Higher Regional Court"") agwaala BBC na mmadụ abụọ rịọrọ mkpeghara banyere ikpe mara ha na aka ha dị ịwakpo Sinetọ Ike Ekweremmadụ ga-ezute ọkaikpe n'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba 2020.","Knetzeger dọrọ anya na ikpe amaala ndị a nke butere ịma ha nha, mana ha riọrọ mkpegharị. Mmadụ abụọ ndị ọzọ arịọghị mpkegharị.Cheta na ụlọikpe a adaala ndị a nha maka mwakpo onye omeiwu bụ Ike Ekweremadu n'obodo Nuremberg n'afọ 2019. Ihe a mere dịka Ekweremadụ gara mba Jamini maka emume iri ji ndị Igbo bi na mba ahụ mere. N'ozi ha ziteere BBC, ha kọwara na ha nyochara ihe mere ọfụma tupu a kpụpụ ndị a ụlọikpe ma daa ha nha. Ozi ahụ kwukwara na mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ na-eme mkpesa maka nha adara ha. Amabeghi nha ego ole adara ndị a mana ozi ahụ kwuru na ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka ha ji akwụ ya bụ ụgwọ. Rebecca Übler bụ onye ziteere BBC ozi banyere okwu sị na ụlọikpe amala mmadụ abụọ ikpe dịka ikpe mmadu abụo ọzọ ka na-aga n'ihu makana ha riọọrọ arịrọ mkpegharị maka nha a adara ha. Übler sị na nha ndị a ga-akwụ bụ ""nke kwa ụbọchị ruo ụbọchị 20"" n'otu n'otu. Mgbe BBC kpọtụrụ Ekweremadu ịnụ olu ya gbasara okwu a, onye na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichuwku kwuru sị; """"achọghị m ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu n'ihi na anyị echefuola ya bụ okwu kamgbe n'ihi na Senator kwuru na ya agbagharala ha"". Cheta na ndị uweojii n'obodo Nuremberg na Jamini nwụchiri mmadụ anọ maka ebubo mwakpo Ike Ekweremadu n'emume iri ji na mba ahụ . Lee ihe onyonyo gosiri etu mwakpo ahụ siri mee: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Etu ị ga-esi pụta n'arịrị maka ọnwụ onye ị hụrụ n'anya" afirika-52616535,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52616535,Coronavirus Outbreak: 'Etu m si chọpụta onye mbụ bu coronavirus na Naịjirịa',"Dọkịta Allison Amarachukwu Karen bụ onye chọpụtara nwoke mbụ si mba Ịtali bubata ọrịa coronavirus na Naịjirịa, kọwara etu o si chọpụta na ihe na-arịa nwoke ahụ bụ coronavirus.","Ọ sị na site na ọzụzụ o nwere, mgbe nwoke ahụ gwara ya na oyi na-ama ya, isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ na ọ matara na o nwereike ịbụ coronavirus. Na nke a mere o ji kpọtụrụ onyeisi ya kpọtụkwara ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrị na Naịjirịa bụ NCDC. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụjọ bara ya ahụ maka mmekọ ya na nwoke ahụ mana o wezugara onwe ya iche maa mee ihe ndị o kwesịrị ka ọ hara ibute ọrịa a. Amarachukwu sị na kamgbe ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekele ya n'ebe ọ dị ukwuu maka mbọ ọ gbara ịchọpụta nwoke a. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Peter." afirika-55204996,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55204996,"Rita Edochie: 'Ị chọwa mpa nnukwu na Nollywood, ị ga-esi n'otu 'room' banye 'room' ọzọ'",Rita Edochie abụghị anụ taa na Nollywood.,Ome ihe nkiri a kwuru ka o si malite egwu ọ ma anya ya kamgbe afọ karịrị iri abụọ ma nyekwa ndụmọdụ etu ndị na-achọ ibanye ihe nkiri ga-esi bụrụ ọkaibe ma tọọ atọ na ya bụ ngalaba. Ọ kpakwara anyị ọchị site n'imere anyị egwuregwu omenaala e ji mara ya. Bia ṅụrịa! Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-45193215,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45193215,ENDSARS: Gọọmentị ehiwela mkparịtaụka n'etiti ndị ntorọbịa na ndị uweojii,Gọọmentị Naịjirịa si na Ministrị na-ahụ maka egwuregwu na ndị ntorọbịa hazie mkparịtaụka n'etiti ndị uweojii na ndị na-anọchi anya ndị ntorọbịa.,"Dịka ha depụtara n'elu ihe ngosi ha wepụtara iji zie ozi maka ya, ha kwuru na ọ bụ ịkpa maka etu mmegbu na mkpagbu ndị uweojii si metụta ndị ntorọbịa. End of Twitter post, 1 Otu onye akpọrọ aha ya so na ndị ga-anọchị anya ndị ntorọbịa bụ Ife Durosimi-Etti agbụrụla onwe ya na ya bụ nzụkọ. O kwuru n'akara Twitter ya kwa na ọ gaghị eso n'ihi na ihe ndị ntorọbịa chọrọ doro anya. Dọkịta Joe Abah bụkwa onye gaara achịkọta ọgbakọ a dekwuru na ọ gaghị emezi ya bụ ihe. Anonymous anarala gọọmentị Naịjirịa ụfọdụ Twitter ha n'ike Otu ndị kpọrọ onwe ha Anonymous ewegharala ụfọdụ akara Twitter gọọmentị Naịjirịa n'ike. Ha mere nke a iji gosi nkwado ha n'ebe ndị na-eme ngagharịiwe gbasara END SARS nọ. Ha kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa nwụchie ma nyochaa ndị ọrụ SARS pụrụiche. Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru onye n'Afrịka etinyela ọnụ n'okwu gbasara ENDSARS na Naịjirịa. Ngalaba ehibere n'Afrịka iji chekwa ikike ruru onye bụ ACHPR n'aha ịchafụ akpọọla oku ka akwụsị ịwakpo ndị na-eme ngagharịiwe n'udo. Ha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha gbasara n'akara Twitter ha ma kwuo na oge eruwo a ga-eji nyocha ndị ọrụ SARS na ebubo niile eboro ha n'ụzọ ziri ezi. Kedụ ndị bụ Anonymous Ndị otu a enweghi ihe maọbụ onyeisi. Mkpụru okwu ha ji aga bụ ""anyị dị igwe"", nke ha ji atụ aka na ọtụtụ mmadụ so n'otu ha. Dịka ha enweghị ndị ọchịchị, onye ọbụla nwereike sio na ya so n'otu a. Nke mekwara ka ndị so otu a nwee ebumnuche dị iche iche, nke mere ha enweghị olileanya otu. Mana, ha bụ ndị na-agba mbọ maka ndị ji aka ike achịgbụ ndị mmadụ. Ha na-eji ịnara ndị mmadụ ogige ịntanetị ha eme ihe a. Ọ bụ ihu nwoke a kpọrọ Guy Fawkes, bụ onye wuru ewu maka akwụkwọ Alan Moore dere a kpọrọ V for Ventetta. N'akwụkwọ ahụ, otu nwoke na-eyi ihu ahụ dịka ọ na-agba mbọ ịkwatu gọọmenti nrụrụaka karịrị na ya. Babajide Sanwo-Olu akpọpụtala aha ndị uweojii anọ a na-enyo maka iwakpo ndị na-eme ngagharịiwe Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu akpọpụtala aha ndị uweojii anọ a na-enyo maka iwakpo ndị na-eme ngagharịiwe na steeti ya. Ọ kpọrọ mmadụ anọ a dịka ọ na-asa otu nwaagbọghọ e setere n'ihe onyonyo ka ndị uweojii na-akpụbanye ya n'ime ụlọọrụ ha. O kwukwara na gọọmentị ya eburula ihe gbasara akparamagwa ndị uweojii n'isi, ma kwuo na e kpewela ndị uweojii anọ a ikpe. O kwuru na gọọmentị ya ewepụtala nde naịra narị abụọ (200m) maka iti ndị nwụrụla nn'aka ndị uweojii aka n'obi na steeti ya. Ma kwukwaa na gọọmentị ya ga-etinye anya n'ihe gbasara mmegbu ndị uweojii. Ọ gakwara n'ihu rịọ ndị e tiri ihe ebe ọ na-eme ngagharịiwe mgbaghara maka nke a. N'ihe gbasara ụgwọ ọnwa ndị uweojii, Sanwo-Olu kwuru na ha etinyewela anya n'ihe gbasara ya n'obi gọọmentị etiti. 'Ndị SARS mekarịrị ihe e dunyere ha' - Bishọpụ Paulinus Ezeokafor Bishọpụ Paulinus Ezeokafor etinyela ọnụ na ngagharịiwe END SARS Bishọpụ Paulinus Ezeokafor bụ bishọpụ ndị Katọlik nke Ọka Dayọsis etinyela ọnụ n'ihe gbasara END SARS. O kwuru na ọ bụ emeghi ihe mgbe e kwesịrị ime ya na-ebute mmebi ihe. O kwuru na ndị SARS emekarịala ihe e dinyere ha, mere ka ndị ntorobịa wewe iwe a ha na-egosi ugbua. Ndị akpụobi achụsasịala ndị na-eme ngagharịiwe na Kano Ndị ji mma nwakporo ndị na-eme ngagharịiwe maka SARS na Kano bu isi obodo Kano steeti. Ndị a mechara chụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe. Ụdịrị ihe a mekwara ụnyaahụ n'Abuja nakwa Legọs dịka ndị ji mma na okporo wakporo ndị a na-eme ngagharịiwe. Ha mebichara ụgbọala ndị mmadụ n'Abuja ụnyaahụ. A na-agba ndị na-eme ngagharịiwe egbe na Jos Ihe onyonyo BBC nwetara na-egosi ebe ndị mmadụ makpuru n'ala na-eti mkpu dịka ụda egbe na-ada ebe a na-eme ngagharịiwe na Jos. Ndị mmadụ n'ime onyonyo ahụ na-eti ""ha na-agba anyị egbe"" n'asụsụ Bekee. Akụkọ kwuru na ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na Jos bụ isi obodo Plateau steeti bụ ndị nọ n'ime ihe onyonyo ahụ. Ha so nzọmụkwụ steeti ndị ọzọ ịme ngagharịiwe gbasara mmegbu na mkpagbu n'aka ndị uweojii n'aha END SARS. Ndị Enugwu amalitela ekpere Dịka ngagharịiwe maka mkpagbụ ndị ọrụ nchekwa na-aga n'ihu, ndị mmadụ nọ n'Enugwu ejirila ekpere malite nke taa. Amalitela ngagharịiwe maka mkpagbu ndị uweojii n'Abakiliki Dị ngagharịiwe maka SARS na mkpagbu ndị ọrụ ncheka amalitela ngagharịiwe n'Abakiliki bụ isi obodo Ebonyi steeti amalitela njem ha Ọdọ egwuregwu dị n'Abakiliki. Ha nọ n'ihu Obi Gọọmentị ochie dị na obodo ahụ. Angela Okorie na-eme ejije sonyere ngagharịiwe END SARS n'Ebonyi steeti Ha na-esi ọnwụ na gọvanọ David Umahi ga-abịarịrị gwa ha okwu. Awakpowela ndị na-eme ngagharịiwe n'Alausa Legọs Ndi amaghị ndị ha bụ wakporo ndị mmadụ pụtara ime ngagharị iwe END SARS n'obi gọọmentị Legọs steeti. Ihe onyonyo pụtara gosiri ebe ndị agboro si n'ime ụgbọala BRT apụta n'igwe ha ma buru kwa osisi na ngwa agha dị icheiche. Ndị mmadụ pụtakwara ịkwu na a na-awakpo ha na-agbakwa egbe n'Alausa bụ ebe ha na-eme ya bụ nzogbu. Ndị na-eme ngagharịiwe rahụrụ n'ihu obi gọọmentị n'Awka Ndị mmadụ mere ngagharị iwe mapụtara n'Awka n'ụbọchị Wenzde lahụrụ n'ihu obi gọọmentị Anambra steeti. Ha lahụrụ ebe ahụ maka na ha chọrọ ka aka na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano pụta bịa zaa ha oku. Otu onye nọ ebe ahụ kwuru na ha na-achọrọ ikpe nkwụmọtọ gbasara ndị niile echere na SARS gburu n'ụlọọrụ ha dị n'Awkuzu. Ọzọ Onye omeiwu ama ama na-anọchite anya Anambra Idemili North and South Federal Constituency n'ulọomeiwu nta bụ Obinna Chidoka ekwuola na ego atọgbọghị n'ọrụ ha dịka ndị omeiwu na gọọmentị etiti. Obinna kwuru nke a mgbe ọ na aza BBC Igbo ajuju ajụrụ ya maka ebubo ego ana ebo ndị omeiwu nke gọọmentị etiti. O kwuru na ihe na-eme ka ndị omeiwu enwere oke ego bụ ụdị ndị ndụ okoko ụfọdụ n'ime ha na-ebi. Ọ sị na ụfọdụ n'ime ha na-enwere ọnọdụ ha dịka ndị omeiwu ga biri oke ego n'ụlọakụ bụ nke ha ji ego oke ụgbụala na okoko ụlọ. Obinna sị ""ụfọdụ ndị otu anyị sị na ọchịchị pụọ na-ebizi ego ụgbụa iji rie nri ọnụ"". Ọ sị na ndị ngagharịiwe bịa na ya ga-egosi ha akwụkwọ e ji akwụkwụ ha ụgwọ ọnwa ka ha mata na anụ adịghị na ya bụ isiazụ. Chieso Iziga-Eruchalu bụ osote onyeis ndị Ọhaneze ndị Igbo galaba ndị ntorobịa kwuo na ya ekwetachaghị ihe Obinna kwuru maka na ha bụ nụnụ na-eri eficha ọnụ n'ala. N'okwu akpụ n'ọnụ bụ ENDSARS, ha abụọ kwekọrịtara na ọrụ ndị uweojii kwesiri ịkpatụ aka ka oyie ihe. Na ihe a ga-eme ka ụmụntorobịa kwusi ngagharịiwe bụ ịme ka obodo dị mma, nyere ndị mmadụ ọtụ na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. ENDSARS: Ndị uweojii ewepụtala atụmatụ ọhụrụ ha ga-eji ahazị ngalaba ga-anọchị SARS Ndị uweojii Naịjirịa ewepụtala usoro ise ha ga-eji hiwe ngalaba ọhụrụ ga-anọchị SARS. N'ihe ha depụtara na Twitter, ha kwuru na ọnweghị onye sị na SARS bụ nke ekposara ekposa ga-eso na otu ọhụrụ a. Ha sị na ọrụ otu ọhụrụ a ga-abụ naanị isi imi n'ala chọpụta mpụ na ohi. Ndị otu ọhụrụ a agaghi na-agaghị agharị. Ha agaghị na-enyocha ekwentị, laptọpụ, na akụrụngwa ndị mmadụ na-enweghị ikike. Ya bụ ozi nke Frank Mba tinyere aka kwukwara na ọnweghị onye ọbụla ga enwere ikpe, ọkacha nke gbasa iji egbe meruo mmadụ ahụ ga-abata na ya bụ otu. ENDSARS: 'Azụrụ ndị SARS Anambra steeti azụ nke ọma' - Kọmịshọna mgbasa ozi Dịka ana eme ngaghrịiwe ENDSARS na steeti niile n'ala Igbo BBC Igbo nwere mkparịtaụka ekwentị ha na ndị isiọchịchị n'ala Igbo. Kọmịshọna mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na akụkọ ndị mmadụ na-akọ mgbasara SARS Ọkụzụ bụ akụkọ mgbeochie. N'iji maa atụ, okwuru na ya bụ James Nwafọ onye ọbụla kpụ n'ọnụ dịka onyeisi ndị SARS Ọkụzụ alaarị ezumike nka ihe karịrị afọ abụọ ya malitere ọrụ dịka kọmịshọna mgbasaozi nke steeti ahụ. Adinuba kwuru na kemgbe ya malitere ọrụ dịka kọmịshọna na steeti ahụ na ya anụbeghị maka nsogbu ndị mmadụ na SARS ebe ahụ. O kwuru na-azụrụ ndị SARS Anambra steeti nke ọma bụ nke mere ha ji akpa ezigbo agwa. N'Abia steeti, Gọvanọ Okezie Ikpeazụ dere n'akara Twitter ya na ha anụla ma hukwa iwe ụmụntorobịa na-eme ngagharịiwe na steeti ahụ. Ọ kwere ha nkwa na ya ga-agba mbọ ihụ gọọmentị etiti nụrụ olu ha. Ndị Enugwu na ndị Imo steeti azaghị ekwenti. N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna mgbasaozi nke Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji kwuru na ngagharịiwe a gbasara gọọmentị etiti, na ọnweghị ka osi gbasa ndị gọomentị steeti. ENDSARS 'protest jollof', ndị na-achọta enyi ọhụrụ nakwa ihe pụrụiche na-eme na ngagharịiwe End Sars Ngagharịiwe maka ịkwụsị ngalaba uweojii bụ Special Anti-Robbery Squad (SARS) na Naịjirịa abanyela n'ụbọchị asatọ. Kemgbe a malitere, ọtụtụ ihe pụrụiche emeela ebe ndị mmadụ gbakọrọ na-egosi iwe ha, ihe ndị ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ya njirimara ezigbo obi ndị Naịjirịa. Ihe ndị ahụ gụnyere etu ndị mmadụ si enyere ibe ha aka n'agbanyeghi na ọtụtụ amabughi onwe ha tupu ha ezute n'ọgbakọ ahụ, etu e si atụkọta ego e ji ahụ na ya bụ ngagharịiwe gara nke ọma nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche. Ihe ndị seliterela isi na ngagharịiwe a: 1) 'Protest jollof' Ndị mmadụ wepụtara onwe ha na-eke nri, mmiri, ihe e ji atagharị ọnụ, iji hụ na ndị mmadụ adaghị mba n'ikwu okwu a na-anụ ndị ntorobịa ọkụ n'obi. Ụfọdụ tụkọtara ego ha, ebe ndị ọzọ ji ego nke ha site nri ma na-eke ndị mmadụ. Nke a bụ usoro ha ji ahụ na okwu a ebighi etu ahụ na-akaghị ya ọnụ. 2) Ndị gara ngagharịiwe gata enyi ọhụrụ: Ụfọdụ ndị mmadụ bu n'obi ịpụta sonye mee naanị ngagharịiwe mgbe ha hapụrụ ụlọ ha, mana okwu dagharịrị. Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị a achọtala enyi, ọyị nakwa ọdị n'obi ha na-atụwaghị anya. Ndị ọzọ enwetala ndị na-ajụ ha ""nwanne ị ga-apụtakwa nke taa?"" 3) Ndị mmadụ na-enyere ibe ha aka: Na Legọs, mmiri ozuzo malitere izo n'ụtụtụ, mana o gbochighi ndị mmadụ ịpụta maka ya bụ ngagharịiwe. Ya mere onye dị ka Feyi jiri wepụta onwe ya wee na-enye nwaanyị ọbụla chọrọ iyipu akwa ya mmiri mara, ohere ịnọ n'ụlọ ya gbanwee akwa ya. 4) Ndị na-atụtụ atịtị ndị mmadụ na-atụfu Dịka ndị mmadụ na-eri nri na-aṅụ mmiri na ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa, e nwere ndị wepụtara onwe ha na-atụtụ ihe ndị ha na-atụfu. Ma n'Enugwu ma na Legọs, ha chọrọ ka e debe ụzọ ọcha dịka ndị ntorobịa na-ekwu uche ha. Ndị Nnewi esorola nzọmụkwụ obodo ala Igbo ndị ọzọ na ngagharịiwe Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed ekwuola na-aghachiela ụlọọrụ ndị SARS n'Awkuzu. Haruna kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo bụ ebe ọ nọ kwuo na gọomentị amalitela imejipupa nkwa ha kwere ndị mmadụ. Ị jụọ ndị ma maka ya, ọkachasị ndị bi na Awka na Dunukofia, ha ga-agwa dị na ngalaba SARS Awkuzu bụ nke ka njọ n'ala Igbo niile maka arụrụala, mmegbu na ogbugbu mmadụ ha na-egbu. Mapụ steeti ebe e mere ngagharịiwe na Naịjirịa A na-ebo ndị ọrụ ebe ha ebubo igbo ndị aka ha kwụọtụ bụ ndị na-enweghị ego ha ga-eji agbara isi onwe ha. Ha na-ebokwa ha ise si ndị ajọ dibia akụkọ ahụ mmadụ ha ji agwọ ọgwụ. Otu edemede ngosi ndị na-eme ngagharịiwe ji na-ekwu na ngagharịiwe EndSARS na-ekwu na SARS Awkuzu bụ nke kacha njọ n'Ọwụwa anyanwụ nakwa na Naịjirịa gbaa gburu gburu. Lee ihe atọ ngagharịiwe ENDSARS agaghị eji ebi nsono a. Ngagharịiwe ENDSARS ajụla ""ị endi"" kemgbe abalị asaa agbanyeghị onyeisi ndị uweojii apụtala kwuo na ya egbosaala ngalaba ọrụ ndị isiekwe ọnwụ a. Onyeisila Muhammadu Buhari apụtakwala zaa oku ndị mmadụ kpọrọ ya site n'ịpụta kwa ha na ya nụrụ olu ha. O kwukwara na ikposa ndị otu SARS bụ otu ụzọ n'ime ụzọ ha chọrọ iji hazịgharịa ọrụ ndị uweojii. Mana agbanyeghị ihe ndị a niile, ngagharịiwe ka na-aga n'ihu na steeti dị iche iche na Naịjirịa. Ụfọdụ ndị na-eme ya bụ ngagharịiwe gwara BBC na ọnwe ihe mere ha agaghị eji kwusi ya bụ ngagharịiwe. Ndị uweojii ka ji mgbọ igwe agbagbu ndị mmadụ bụ ndị na-eme ngagharịiwe Ndị mmadụ sị na ihe ka na-ewe ha iwe bụ na ndị uweojii ji mgbọigwe agbagbu ndị na-eme ngagharịiwe. Ha sị na iji mgbọ igwe, ịgba ha mmiri, ịkpọchị ha, ịtị ha ihe so na mmegbu ndị uweoji na-eme ndị mmadụ bụ ihe mere ha ji eme ya bụ ngagharịiwe. Ha kwuru na gbanyeghị na ha ka nọ na ya bụ ngagharịiwe, ndị uweojii ka na-egbukwa ndị mmadụ dịka ha na kpochikwa ndị ụfọdụ. Gọọmentị na-akpụ ụkwụ n'ala imachi SARS Ọ bụghị taa ka ndị mmadụ bidoro iti mkpu ka e machị SARS. Ihe dị ka afọ anọ ugbua, ndị mmadụ nakwa ndị otu kwuuru onwe ha amalitelaarị tiwe mkpu na Twitter maka ajọ ihe ndị otu ọrụ a na-eme. Ụfọdụ ndị a na-egosi ihe onyonyo mkpagbu na ihe ndị uweojii a ji ndị ndị ntorobia eme. Ndị mmadụ ekwenyeghị n'ihe gọọmentị na-ekwu Ọtụtụ mmadụ ekwenyeghị n'ihe gọọmentị kwuru maka ikposa SARS. Nke bụ maka na nke a abụghị mbụ . Lee Mapụ ebe emere ngagharịiwe EndSARS na Naịjirịa Mapụ ebe emere ngagharịiwe na Naịjirịa N'ụbọchị 13 October bụ abali asaa ụmụntorobịa malitere ngagharịiwe ENDSARS na Naịjirịa. Ụmụntorobị na ndị ama ama pụtara igosi iwe ha n'ụdị pụrụiche n'ike na ebube na steeti dị iche iche. Ka chi na-efo bụ ka steeti dị iche iche na-esonye na ya bụ ngagharịiwe. Ka ọ dị taa, steeti iri na isii gụnyere Abuja na-eme ya bụ ngagharịwe. Steeti ndị a bụ Abuja, Kwara, Oyo,Oshun, Kogi, Ondo, Ogun, Legọs, Edo, Anambra, Enugwu, Imo, Delta, Abia, Cross River na River steeti. Ihe Flavour, Phyno, KC Limpopo na Zoro kwuru na ngagharịiwe END SARS mere n'Enugwu A malitela ime ngagharịiwe maka nkwụsị Special Anti-Robbery Squad (SARS) na Naịjirịa n'Okpara Square dị n'Enugwu steeti. Ndị Enugwu sonyere taa n'ihe mere ya ụbọchị asaa a malitere ime ngagharịiwe a na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa. Lee ka o si aga ebe a EndSARS abụrụla otu aka rụtara mmanụ zuru ọha na Twitter Dịka ebidoro ngagharịiwe EndSARS, obutela ọtụtụ okwu ọkchasi na Twitter. Lee nchịkọta ụfọdụ ya ebe a : #BuhariHasBeenABadBoy - Dịka ndị ntaakụkọ gbara otu nwa agbọghọ ajụjọ onụ maka i so eme ngagharịiwe, O kwuputara na ndị uweojii ji egbe pụta mana ndị na-eme ngagharịwe bu ndị ntoroọbia gba aka. O kwuru na ha mechaa nke EndSARS na ọzọ ha ga-eme bụ maka Buharị n'ihi na obi adịghị ha mma maka ọchịchi ya, were sị na n'okwu bekee ""Buhari has been a bad boy"". N'otu aka ahụ ihe na-ewu na soshal Midia bụ ngagharịiwe nke Rivas steeti dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na steeti ahụ na-ekwu na ha ga-eme ngaghariiwe na-agbanyeghị na Gọvanọ steeti ahụ sị ha emela ngagharịiwe. Ebe ngaharịiwe na-akpotụ na Ibadan, Akure, Uyo,Akure na nke Enugwu. Ihe ụfọdụ ndị omeiwu na-ekwu maka ngagharịiwe a Onye Omeiwu Rochas Okorocha ekwuola na site n'iwu nke 43, ka ndị ụlọomeiwu nye ikike ka-atọghapu ndị niile na-eme ngagharịiwe ha jichiri. N'aka nke ọzọ ka omeiwu Ifeanyi Ubah gbadoro ụkwụ n'ịwu ndị omeiwu nke 43 were kelee onyeisi ndị uweojii maka ịkwụsị ndị uweojii SARS. Lekwa ka o si aga na Porthacourt Ha nọ n'ihu ụlọ ndị uweojii akpọ oku ka kọmịshọna ndị uweojii pụta bịa gwa ha okwu. N'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị uweojii agbaala ha gburugburu ebe ha gbakọrọ ime ka ọha nụrụ olu ha. Ndị otiegwu a ma ama dịka Flavour, Phyno, Zoro na ndị ọzọ kwuru na ha ga-edu ndị mmadụ n'ime ngagharịiwe n'Enugwu maka mkpamkpa ngalaba uweojii Naịjirịa a kpọrọ SARS na-akpa. 'Anyị ga-emerịrị ngagharịiwe na Port Harcourt taa' Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike amachiela ngagharịiwe maka nkagbu SARS ndị mmadụ na-akwado ime na steeti ya taa. Mana ndị mmadụ ka na-esi ọnwụ na ha ga-emerịrị ya n'ihi na iwu Naịjirịa kwadoro ime ngagharị udo. Ndị gụnyere Tacha nke si na Big Brother Naija nke agba nke anọ so buru ya n'isi ma na-ekwu na ha ga-emerịrị ya bụ ngagharị. Ọ gara n'ihu kwuo na Wike kwesịrị ịma na enweghi ihe ọjọọ dị n'ihe ha chọrọ ime, n'ihi na ọ bụ ọkaiwu. 'Ọ bụ ọkwọụgbọala m ka e gburu na ngagharịiwe na Legọs' Otu nwoke aha ya bụ Sam Okafor gwara BBC na onye egburu na-ebe a na-eme ngagahrịiwe na mpaghara Surulere di na Legọs bu ọkwa ụgbọala ya. Maazị Okafor sị na ha nọ na njem ị ga Surulere oge ọnwụ jekwuru ọkwọụgbọala ya aha ya bụ Ikechukwu Ilohamauzo pụrụ ikiri ihe na-eme tupu mgbọ were tụọ ya. ""Ọ bụ Ilupeju ka anyị na-aga tupu ihe a eme."" Akwa arịrị ekweghị nwoke ahụ kwuo okwu ọfụma dịka BBC na-agba ya ajụjụ ọnụ. Ndị uweojii si na Maazị Ilohamauzo dị afọ 55. N'ihe onyonyo nakwa akụkọ pụtara na soshal midia gosiri ebe otu nwoke iyi akwa mee mee ma dinara n'ala dịka ndị ọrụ ahụike na-azọ ndụ ya. Ndị ọzọ gosikwara ebe ndị mmadụ na-agba ọzọ ma na-asị na a na-agba ha egbe. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ndi uweojii abịala ebe ahu ma buru ozu onye ahụ agbara egbe pụọ. Ndị uweojii ahụ bịakwara ịwakpo onye ntaakụkọ BBC tupu ọ kọwa onye ọ bụ. Ihe onyonyo nakwa akụkọ ndị mmadụ tinyere na soshal midia na-akọwa na ọtụtrụ mmadụ merụrụ ahụ na mpaghara Surulere ahụ. Otu onye ntaakụkọ TechNext desre n'akara Twitter ya na ihe na-eme na Surulere dị ka agha. Ihe onyonyo ndị ọzọ na-egosikwa ebe akpụ ụmụagbọghọ abụọ abanye ụlọ ọrụ ndị uweojii a kpọrọ ""Area C"" dịkwa na Surulere ahụ. ""Ọ bụ ndị omekome wakporo anyị"" - Ndị uweojii Ndị uweojii n'onwe ha na-agọ na ọ bụghị ha gbara egbe gburu nwa amadi ahụ ma kwuo na mgbọ gburu otu onye otu ha dịka mmadụ abụọ merụrụ ahụ. Ndị uweojii sị na ọ bụ ndị bịara ịwakpo ụlọ ọrụ ha gbara egbe gburu ndị a. Nke a na-abịa dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa na mkposa gọọmentị ya mere ngalaba ""Special Anti Robbery Squad"" (SARS) bu ụzọ mbụ na njem ịhazigharị ndị uweojii na Naịjirịa. Ihe dịmkpa Buhari kwuru Ndị ntorobịa malitere ime ngagharịiwe kemgbe abali isii maka mkpagbụ SARS. Na Mọnde, ngagharịiwe a ruru Ọnịcha nakwa Ụmụahịa. Otu onye n'ime ndị na-eme ngagharịiwe gwara BBC Igbo na ihe mere ha ka ji na-eme ngagagharịiwe n'agbanayeghị na gọọmentị sị na ha akagbụọla ngalaba ahụ sị na obi ejubeghị ha afọ banyere ihe a. ""Anyị chọrọ ka Buhari bịa gwa anyị okwu. Ọ karịghị iji ọnụ ya gwa anyị okwu."" Ngagharịiwe n'Umuahia butere ụzọ ịfashị dịka ndị ntoroọbịa kputara n'uju. Ha gara isi ụlọ ọrụ ndị uweojii di n'ụzọ Bende ma rukwa ụlọ ndị Omeiwu na steeti ahụ nakwa obi gọọmentị Abịa. Ndị mmadụ pụtara maka ngagharịiwe Ndi mmadụ pụtara ngagharịiwe n'Umuahia Ndị mmadụ pụtara ngagharịiwe n'Umuahia N'agbanyeghi na onyeisi ndị uweojii na Naịjiria bụ Mohammed Adamu kwuputara ụnyaahụ na ha amachiela SARS, ndị nọ n'Ọnịcha, Aba, Ụmụahịa, Ọka, Legọs nakwa mpaghara ndị ọzọ ka na-ekwusi ike na ha ga-emegide ngagharịiwe a ruo mgbe ọ mịtara mkpụrụ mgbanwe. Ha kwukwara na ha agaghị akwụsị ime ngagharịiwe ruo mgbe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari pụtara kwuo okwu. Ha kwuru na otun'ime ihe ha chọrọ bụ ka a kpụpụ ndị uweojii ndị gburula mmadụ ụlọikpe. Buhari were ọnụ ya kwuo maka mkposa Sars - Ụmụ Naịjirịa Ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari were ọnụ ya kwuo maka mkposa Sars tupu ha ekwete. Nke a na-abịa dịka onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu kwuru na ha ekposaala ngalaba ndị uweoji a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' na steeti niile dị na Naịjirịa. Ọtụtụ n'ime ha kwuru na nke a abụghị nke mbụ ndị uweojii na-ekwu na ha ekposaala Sars, mana e mechaa, ihe na-ebenụ ka na-ebekwa. Lee etu ụfọdụ si kwuo ya na soshal midia: Prince Big Brother Naija kwuru na onyeisiala kwesịrị iji aka ya gwa ndị ọ na-achị okwu Afam Deluxo kwuru na ọ bụrụ na Buhari ekwughị okwu maka nke a, ngagharịiwe agaghị akwụsị Ayeni Adekunle kwuru na onyeisi ndị uweoji kwesịsị ịgba arụkwaghịm, ma kwukwaa na ọ bụ onyeisiala kwesịrị ikwu maka mkposa Sars Onye ọzọ aha ya bụ Cheta kwuru na ọ bụghị taa ka ndị isi uweojii tiri iwu mana ndị otu ya egeghị ntị Ada Bekee kwuru na ihe ọ chọrọ bụ okwu ikike si n'aka onyeisiala nke Bekee na-akpọ 'Executive Order' Etu Sars si malite Simeon Midenda bụ onye hibere otu Sars na legọs n'afọ 1992 SARS bụ mkpọbiri aha nke pụtara 'Special Anti-Robbery Squad'. Ha bụ ngalaba pụrụ iche n'ime otu ndị uweojii nke ọrụ ha bụ igbochi nakwa inwuchi ndị o ji egbe ezu, ndị ntọrị mmadụ, nakwa arụ ndị ọzọ tara akpụ n'obodo. Dịka Frank Mba, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii si kwuo, ụfọdụ ndị Sars sokwa aluso ndị Boko Haram ọgụ na mpaghara ugwu Naịjirịa. E hibere otu Sars n'afọ 1992, onye hibere ya bụ onye uweojii aha ya bụ Simeon Danladi Midenda. Tupu oge a, ọ bụ ngalaba a kpọrọ 'Criminal Investigation Department' (CID) na-eleba anya n'okwu gbasara ndị ojiegbe ezu. Mana n'ime otu CID a, e nwekwara ngalaba a na-akpọ 'Anti-Robbery Squad'. Na mkparịtaụka ya na ụlọorụ ntaakụkọ vanguard, Midenda kọwara na oge ọ malitere otu a, ha anaghị eyi akwa maọbụ ụgbọala ndị uweojii arụ ọrụ, mana ha anaghịkwa ebu egbe akpagharị n'ụzọ. Nke a bụ ụzọ iji zoo onwe ha ka ndị ekperima ghara ịma na ha bụ ndị uweojii. N'oge ahụ, naanị na Legọs ka e nwere Sars, mana o mechara gbasaa na steeti niile na Naịjirịa. Ihe gburu Sars Ụfọdụ na-ekwu na ha anaghị ama ndị bụ Sars na ndị bụ ndị ekperima Ndị mmadụ malitere iweta mkpesa na ndị Sars na-eyizi ha egwu. Ọtụtu na-ekwu na onye ya na ibe ya nwere nghọtahie, onye ahụ a ga kpọọrọ ya ndị Sars. Ọtụtụ onyonyo pụtakwara na soshal midia ebe ndị Sars na-emekpa ndị mmadụ ahụ. Ụfọdụ oge ka e boro ebubo na ndị Sars gburu mmadụ. N'ihi na ha anaghị eyi akwa ndị uweojii, bịakwa na-ebu nnukwu egbe, ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ama ndị bụ ndị Sars na ndị bụ ekperima. Ihe ndị a socha na mkpesa mere ọtụtụ ji ekwu ka e mechie ngalaba Sars. Anyị ekposaala Sars kpamkpam - IGP Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ekposala ngalaba Special Anti-Robbery Squad (SARS) niile dị na steeti 36 dị na Naịjirịa taa bụ ụbọchị Ọktoba 11,2020. O kwuru na o mere nke a iji wee gere oku ụmụ Naịjirịa na-akpọ kamgbe ka akwụsị atụmaatụ SARS. Adamu kwuru nkea n'ozi o zipuru ụmụ Naịjirịa n'onyonyo Facebook. O kwuru na mkposa a pụtara na a ga-etinyezi ndị niile na-arụ ebe ahụ na ngalaba ndị uweojii ndị ọzọ. O kwuru na ụlọọrụ ya echewela maka ngalaba ọzọ ga-ebuso ohi na ntọ agha dịka esi hiwe SARS ịme ya mana ugbua a ga-akpọpụta aha ngalaba ọhụrụ ahụ mgbe oge ruru. Iji wee gbochi nsogbu SARS butere, o kwuru na ụlọọrụ ya ehiwela ọgabkọ a kpọrọ 'Citizens' and Strategic Stakeholders' Forum' ebe a ga na-enwe mkparịtaụka n'etiti ndị Naịjirịa na ndị isi uweojii. O kwukwara na ndị uweojii ehiwela ọgbakọ nyocha ga-agụnye otu ndị na-ahụ maka ikike dịrị onwe ka ha nandị uweojii rụkọọ ọrụ n'inyocha ikpe gbasara mmegide ikike dịrị onye. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkposa Sars Festus Ogun kwuru na onyeisiala kwesịrị ikwu okwu maka ya Joe Abah kwuru na obi dị ya mma maka mkposa Sars Otiegwu Banky W kwuru na ikposa Sars ebibeghi okwu a Etụ ndị Awka si mee ngagharaiwe EndSARs Etu ngagharịiwe megide SARS si aga n'Awka dị n'Anambra Steetị Ndị ntoroọbịa bi n'Awka dị n'Anambra Steetị amalitela ime ngagharịiwe megide mkpagbu ha na-ahụta n'aka ngalaba uweojii a kpọrọ SARS. Ha malitere nke a n'ebe a kpọrọ 'Alex Ekwueme Square dị n'Awka ma buruzie ya gawa 'Aroma' dịka ha na-abụ abụ. Ha si ebe ahụ gawa n'ahịa Eke Awka Ndị ngagharịiwe n'ahịa Eke Awka Ahịa Eke Awka Ndị a na-eme ngagharịiwe bu ya gaa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Awka ime mkpesa ha. Ndị a na-eme ngagharịiwe ka ha na-echa ka kọmishọna ndị uweojii bịa gwa ha okwu. Ụfọdụ ha nọ ọdụ n'ala na-eche ozi n'aka ndị uweojii Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ John B. Abang pụtara ịbịa zaa oku ndị a na-eme ngagharịiwe na-akpọ. Ọ gwara ha na ndịisi ndị uweojii na Naịjirịa ga-eleba okwu ndị anya n'oge na-adịghị anya. Mgbe John B. Abang bụ kọmishọna uweojii n'Anambra Steetị na-agwa ndị ngagharịiwe okwu n'Awka Abang gara n'ihu kwee nkwa na ụlọọrụ onyeisi ndị uweojii ga-enwegharị ngalaba SARS kpamkpam. Ndị ntoroọbịa a kpọkwara oku ka a tọhapụ mmadụ niile ngalaba SARS Awkuzu nwuchiri n'ụzọ na-ezighi ezi. Ndị a ma ama pụtara ịkwado ngagharịiwe megide SARS Ndị otiegwu DJ Spinall na Wurld Ụmụ Naịjirịa na-ekwupụta iwe ha maka mmakpa ahụ ndị uweojii na-emekpa ụmụ mmadụ, ọ kachasị ngalaba ndị uweojii a kpọrọ Sars. Ọtụtụ ndị a ma ama, ma ndị otiegwu nakwa ndị na-eme ihe ejije Nollywood, sonyechara na ngagharịiwe a. SARS pụtara 'Special Anti-Robbery Squad' na bekke. Ha bụ ngalaba e kepụtara ibuso ndị ojiegbeezu agha n'ụzọ pụrụ iche. Mana ọtụtụ na-ekwu na ndị Sars ahapụla ọrụ ha ma na-emenyụ ụmụ mmadụ anya. Ugboro ugboro ka ndị mmadụ kpọrọ oku ka e mechie ngala uwwojii a akpọrọ Sars, mana gọọmentị emeghị ihe ọbụla gbara ọkpụrụkpụ maka nkea. Ya kpatara onye ọbụla ji malite ngagharịiwe, n'ihi na Igbo kwuru na ""ọ bụrụ na agbaghị ụzọ owere mgba, ọ gaghị echi."" Ngagharịiwe a mere na steeti dị icheiche na Naịjirịa gụnyere: Lee ụfọdụ ndị a ma ama sonyere na ya bụ ngagharịiwe: Genevieve Nnaji kọrọ akụkọ etu ndị Sars si mekpaa nwanne ya nwaanyị ahụ: Otiegwu Falz bu ya bụ ngagharịiwe n'isi. Onye ọkpa ọchị e ji Mr Macaronii mara sonyekwara na ya bụ ngagharịiwe. Runtown sokwa ya: Tiwa Savage nọkwa ebe ahụ Lekwa Zoro Ngagharịiwe a gara n'ihu n'agbanyeghị na ndị uweojii ekwuola na ha amachiela ndị Sars ịkwụ n'ụzọ. Ha kwukwara na ndị Sars enweghị ikike ịnyocha ekwentị mmadụ, maọbụ nwuchie mmadụ n'ihi na onye ahụ sere tatoo maọbụ na ọ kpara isi. Naira Marley na ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nwere mkparitaụka maka omekome ndị ọrụ Sars. Frank Mba, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nyere nkọwa ahụ oge ya na otiegwu a kpọrọ Naira Marley nwere mkparataụka na Instagram. Naira Marley chọburu ịhazi ngagharịiwe, mana mkparịtaụka ya na Frank Mba mere ka ọ kagbuo ya. Mana nke a enyeghị ndị mmadụ obi ụtọ chaachaa Ọtụtụ ndị Naịjirịa ekwuola uche obi ha maka atụmatụ ọhụru a ga-eji hazịgharị ndị ọrụ uweojii pụrụiche bụ Federal Special Anti-Robbery Squad eji SARS mara. Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Mohammed Adamu enyela iwu ga-ahazigharịa etu ndị uweojii a pụrụiche si arụ ọrụ . Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-eti mkpu na ndị uweojii a pụrụiche na-akpa mkpa mkpa dị ọjụọ nke na-ebute ọnwụ ụfọdụ ndị nkịtị aka ha dị ọcha. Tupu etinye iwu a, ọtụtụ ndị Naijirịa nke gụnyere ndị na-eti egwu, ndị na-eme ihe ejije na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu bidoro tiwa mkpu maka etu ndị uweojii a si arụ ọrụ. Dịka etinyere iwu ọhụru a, afọ ejughi ọtụtụ ndị mmadụ dịka ha kwuru na ihe na-ebe ka na ebe. Gụọ ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru Oti egwu Paul Okoye eji Rudeboy mara bidoro kamgbe na-ekwu na aka ndị SARS ji arụ ọrụ ha ezighị ezi. O kwuru ka onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo tinye ọnụ na ya bụ okwu. N'otu aka ahụ ka Okechuklwu Ukeje eji Mr.Raw mara na-etikwa egwu kwuru na-atụmatụ ọhụru a bu ihe ochie. O kwuru ka ndị uweojii kpọpụta ndị a na-eme arụ a ma kpee ha ikpe ka ụwa hụ. Gee ya n'uju ebe a Maka nghazịharị ndị uweojii FSARS Ọ bụ okwu a butere ka Adamu kagbuo etu ndị uweojii a si arụ ọrụ ma wepụta atụmatụ ọzọ etu ha ga-esi arụ ọrụ ha. Gụọ ya ebe a : Ndị uweojii depụtakwara akara ekwentị a ga-eji eme mkpesa maka mmegbu n'aka ndị uweojii IGP Monitoring Unit: 08036242591 FSARS: 08038537625 08036067446 08036059332 08069702133 FORCE PUBLIC COMPLAINT BUREAU 07056792065 Calls/SMS/whatsapp 08088450152 Calls/SMS/whatsapp Lee etu o siri gaa n'afọ 2018 mgbe gọọmentị nyere iwu ka a hazịgharịa ndị otu uweojii SARS Ụnyaahụ bụ ụbọchị Yemi Osinbajo bụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala nyere onyeisi ndị uweojii iwu ka ọ wụghara ngalaba ụlọọrụ SARS. Nke a bụ n'ihi mkpesa ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa mere banyere mwakpo na mmekpa ahụ ha na-enwete n'aka ndị ọrụ nchekwa SARS. Mwogharị ndị ọrụ nchekwa SARS ebutela ọtụtụ okwu site n'akara ọtụtụ ndị Naịjirịa na soshal midia. Ụfọdụ kwuru na ọ bụghị ịgbanwe aha ya site SARS baa na FSARS bụ isi kama na ọ bụ ka ekpochapụha kpamkpam. Ndị ọzọ toro atụmatụ a ma kwuo na ọ bụ ezigbo ihe dịka Osinbajo arụọla ezigbo ọrụ Buhari na-enweghi ike ịrụ mgbe ọ nọ na Naịjirịa. Ndị ọzọ kwuru na Osinbajo arụghị ọrụ ahụ n'ike nke aka ya kama na ọ bụ Buhari nyere ikike ka wogharịa ndị ọrụ nchekwa SARS. Mgbe BBC Igbo gbara Ben Motuanya bụ odeakwụkwọ mgbasa ozi otu na-ahụ maka mmekọrịta ndị obodo na ndị uweojii akpọrọ PCRC n'ịchafụ ajụjụ, O kwuru na mwogharị ahụ dị mma, kama na ọ ka fọdụrụ bụ ihe ndị a ga-eme iji chekwa ugwu dịrị ndị uweojii. O kwuru na e kwesiri ikpokọta ha niile ọnụ n'okpuru ọchịchị onyeisi ndị uweojii steeti ọbụla na abụghị onyeisi ha ị nọ n'Abuja. Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47088187,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47088187,A tụhapụla onyeisioche APC n'Abia,Onụ na-ekwuru uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche pati APC n'Abia steeti nọzi n'ụlọ ọgwụ ezuike.,"A tọọrọ Nwamkpa na mgbede ụbọchị onyeisiala gara Abia maka achụm nta vootu. O sị na aka ejidebeghi ndị a tọọrọ nwoke ahụ, ma na ha nọ́ esosi ha n'ike. A tọọrọ Nwamkpa n'ụzọ korota Aba dị n'Isialangwa, n'elekere itoolu nke mgbede ụbochị Jenụwarị iri abụọ na itoolu. Amabeghị ma akwuwu ụgwọ iji napụta Donatus Nwamkpa n'aka ndi ji ya. Itọọrọ mmadụ bu ihe na-eme ugboro kwa ugboro na Naịjirịa. Ọtụtu mgbe, akwụọ ọgwọ, ahapụ onye eji. Akụkọ ka n'abịa." afirika-45843805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45843805,Obodo ọkụ gbara n'Abia steeti etiila mkpu ọzọ,Mmanụ ụgbọala na-ehi na Umuaduru ọzọ,"Ndị bi n'obodo Umuaduru n'Abia steeti etiila mkpu ọzọ makana mmanụ ụgbọala ebidokwa ihi n'ala. Cheta na ọ bụ ụbọchị abụọ garaaga ka nnukwu ọkụ gbagburu ọtụtụ mmadụ n'obodo ahụ ebe a ga ịkuru mmanụ n'ehi n'ala. Ndị uweojii kwuru na ha agawala ndị ụlọọrụ NNPC maka ịnyocha ebe a na-ehi. Ntorobia Ohaneze Ndigbo na mba ụwa akwadoola Peter Obi Ndị ntorobia Ohaneze Ndigbo na mba ụwa na-ekele onye ji ọkọlọtọ PDP bụ Atiku Abubakar makana ọ họpụta Peter Obi dịka onye ga-eso ya n'ọsọ ntuliaka 2019 maka oche onyeisiala. Otu a kwuru na nhazi ala Naijiria nke akpọrọ ''restructuring'' ka di ndị Igbo mkpa nakwa na a mara na Peter Obi ga-akwado ha na yabu ihe. N'ofesi Ndị ụlọọrụ Red Cross nke mba ụwa na-arịọ gọọmentị Naịjirịa ka ha biko gba mbo hụ na ndị agha Boko Haram tọghapụ ndị otu ụlọọrụ ha abuọ ha torọ ka mgbe ọnwa Maach. Red Cross na-arịọ Boko Haram ka ha mee ebere tọhapu ndị a makana a gburu onye ọzọ ha tọrọ n'ime ọnwa September. N'egwuregwu Novak Djokovic bụ dike ugbua makana o meriela Borna Coric n'asọmpị tennis nke agba na Shanghai. Mmeri a ga-eme ka Djokovic bụ v onye abụọ n'ime ndị kachasị agba tennis na mba ụwa. Gee nkeji ugbua Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Archbishop nke Canterbury etinyela ọnụ na ntụlịaka 2019 Archbishọp nke Canterbury bu Justin Welby etinyela ọnụ n'okwu gbasara ntuliaka 2019. Ọ gwara gọọmentị etiti ha mee ka ntụlịaka ahụ bụrụ nke kwụ ọtọ na-ekwu na nke a ga-ebute udo na ọganihụ n'ala Naịjirịa. Ọ gwakwara ndị ụka Kraisti niile nọ na Naịjirịa ha jisike n'ekpere maka ọdịnma obodo. Ihe a niile mere n'ọgbakọ akpọrọ ""Interfaith initiative for peace"". Ọzọ Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu. Obi adịghị ndị gọv PDP na ndị ndu pati ahu n' ọwụwa anywanwụ mma maka nhọrọ Atiku họrọ Peter Obi dịka osote ya. Ha kwuru na ọ bụ maka na Atiku ajụghịha ase tupu ọ họrọ Obi, ebe ha chọbụrụ ka ọ bụrụ Charles Soludo, onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti(CBN). N'Egwuregwu, A kpụpụla mmadụ asaa gụnyere onye bụbu minista egwuregwu na mba Kenya a kpọrọ Hassan Wario ụlọịkpe maka nrụrụaka. E boro ha ebubo izuru ego enyere ndị egwuregwu iji kwado ma mee njem asọmpị Olimpiks n'afọ 2016. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Lee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo" 45457780,https://www.bbc.com/igbo/45457780,Boko Haram: Ndị agha ụgbọelu awakpoola ọhịa Sambisa,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Ndịagha ụgbọelu awakpoola Sambisa Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa nke operation LAFIYA DOLE ekwuola na ha agbasala ebe nzuzo ndị Boko Haram dị na Kollaram, Bula Korege nke ime oke ọhịa Sambisa. Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Ibikunle Daramola kwuru na nke a mere ụnyaahụ bụ abali asaa ọnwa Seputemba. Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a FSAR ga na-eyi uwe ndị uweojii - Idris Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa FSARS kwụsi ị na-eyi uwe na abụghị nke ndịuweojii na-arụ ọrụ. O kwuru nke a site n'ọnụ Adepoju Ilori bụ onye na-ahụ maka FSARS na mpaghara ndịda anyanwụ nke Naịjirịa. Onyeisi uweojii ahazigharịala SARS Akụkọ si mba Egypt Mba egypt amaala mmadụ iri asaa na ise ikpe ọnwụ ma tụọ ihe mmadụ iri anọ na asaa mkpọrọ ọka ndụ ha niile maka ọgbagbara mere n'afọ 2013 mgbe achụpụrụ onyeisiala bụ Mohammed Morsi. Ndị amara ikpe a bụ ndị okpukperechi alakụba, ndị ụlọọrụ Amnesty international akatọọla ya bụ ikpe ma kwuo na o megidere iwu na-achi mba Egypt. N'egwuregwu Ndị Super Eagles nke Naịjirịa ji ọkpụ atọ a na-asataghi otu merie ndị Seychelles n'asọmpiitozuoke n'iko mba Afrịka. Ahmed Musa, Chidozie Awaziem na Odion Ighalo so na ndị nyere goolu ndị ahụ. Nkeji nke abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke abalịa Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala Ọnọdụ ụzọ ndị dị na mpaghara ọwụwanyanwụ nke Naịjirịa na-agbazi ndị ọkwọ ụgbọala anya mmiri. Gọọmenti etiti ewepụtala ndepụta ebe ha ji ọrụ n'ọwụwa anyanwụ Omotala Jelade Ekeinde ebeela akwa maka Leah Sheribu Onye na-eme ihe onyonyo a ma ama bụ Omotala Jelade Ekeinde etinyela ọnụ n'okwu gbasara nwantakịrị nwaanyị ndị Boko Haram tọọrọ kamgbe bụ leah Sharibu. Omotala kwuru na ọ ga-abụ ihe ịgba anya mmiri ma ihe ọjọọ ọbụla me ya bụ nwa bụ onye Boko haram ji maka okpukpe ya. Naịjirịa Aka chịburu Sokoto steeti bụ Attahiru Bafarawa gara Owere ụnyaahụ. Attahiru Bafarawa chịburu dịka gọvanọ Sokoto Ọ gara ịchụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala ọ chọrọ ịzọ na 2019, nọrọ ebe ahụ kwuo enyegodi na onyeisiala Muhammadu Buhari afọ 20 , o nweghi ihe kwesiri idozi akụnaụba Naịjirịa. Akụkọ mba ofesi Ọ bụrụ na ọnụ gị ezughi ike, o nwere ike ibuba gị nga. Papadopoulos kwuru na a gwara ya na ndị Rọshịa nwere atịtị ha ji gbasara Hillary Clinton Onye kwutere ihe Amerịka jiri bido inyocha Rọshịa maka ntuliaka ya na 2016 bụ George Papadopulous abala nga mkpụrụ ụbọchị iri na anọ. N'egwuregwu, Ajentina egosila na ma Messi anọ ya ma ọ nọghị ya, ha na-eme ihe siri ike. Giovanni Simeone na Gonzalo martinez nyere goolu ọkpụ atọ asataghị otu n'asọmpi enyi na enyi ha na mba Guatemala gbara. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Restructuring' ka mma karịa referadum" afirika-44176696,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44176696,Ara m bụ oke ibu arụ nye m,Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya.,"Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume. Ihe a bụ akụkọ ọtụtụ ndị ụmụnwa nwere ara ukwu na-ahụ. ""Kamgbe ahụ anaghị m eji azụ m, arahụ ụra, kama akụkụ m"" dịka Violet kwuru. O kwuru na ihe ga-egbo nsogbu ahụ bụ ịwa ara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44450019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44450019,MKO Abiola: Ihe 11 ị na-amaghị maka ya,"Iji cheta ntuliaka emere n'ụbọchị iri na abụọ nke Juun afọ 1993 nakwa MKO Abiola dịka onye meriri, lee ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma banyere Abiola.","Abiola nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998 bụ ụbọchị ekwesịrị ịtọhapụ ya. N'afọ gara aga, onyeisiala Muhammadu Buhari kwanyere Abiola ugwu kachasị na Naịjirịa nke a na-enye ndị isiala bụ GCFR na bekee. Ọ kpọpụtara ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun, afọ 1993 dịka ụbọchị ọhụrụ maka ncheta ọchịchị onyekwuouche ya. Ọtụtụ ndị nwereike ị na-ajụ ihe butere oke okwu a gbasara Abiola nakwa ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juun afọ 1993. Lee ụfọdụ ihe ndị gbapụtara ihe na ndụ MKO Abiola. Abiola nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998 bụ ụbọchị ekwesịrị ịtọhapụ ya. Ihe ịkwesiri ịma maka Abiola Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43341167,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43341167,Ndị agha Naịjirịa: Anya anyị adịghị n'iwere ọchịchi,"N'akwụkwọ ozi ha wepụtara ụnyaahụ, ndị isi ndị agha ala Naịjirịa ekwetaghị n'atụmuche osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu na ha ga-ewegharị ọchịchị ma ọ bụrụ na ọchịchị onyekwuouche gaa n'ihu na ịlọghachị azụ dị ka ọ si eme ugbua.","Tukur Buratai bụ onyeisi ndị agha Naịjirịa Ha gwara ndị Naịjirịa ka ha ghara iji okwu osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu kpọrọ ihe. Abalị ole na ole gara aga, oge ha na-enwe nrụrịtaụka n'ụlọ omeiwu ukwu banyere otu ndị gọvanọ ụfọdụ si agba ndị esoghị ha mgba n'ụzọ pụrụ iche, Ekweremadụ tụrụ arịrị n'etu ọchịchị onyekwuoucheya si ala azụ na Naịjirịa, nwere ike ime ka ndị agha bịa were ọchịchị ọzọ. Ndị agha Naijiria Ma na ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Brigadier-Generalụ John Agim, kwuru n'akwụkwụkwọ ozi ahụ na ndị agha Naịjirịa bụ ndị mara ọrụ dịrị ha, na ha enweghị ebumnaobi ọbụla ibanye na ndọrọndọrọ ọchịchị. O kwuru na okwu Ekweremadu nke dị ka okwu ndụmọdụ e jiri obi ọcha kwuo bụ 'mkparị' nye ndị agha Naịjirịa."" Ọ gara n'ihu kwuo na ndị agha kwenyere ma na-ehube isi n'ọchịchị onyekwuoucheya. ""Mgbe ọchịchị si n'aka ndị agha lọghachị n'aka ndị nkịtị n'afọ 1999, e wepụrụ ndị agha niile bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. E mere nke a iji gbanahụ ha ịsa ndị agha ndị na-etolite etolite isi, ka ọchịchị ndị nkịtị were zụgharia ndị agha, ka ha na-arụ ọrụ ha dịka o kwesịirị."" ""Ka ọ na-erute n'afọ 2009, ọ were anya na site n'ọzụzụ mbụ a na-enye ndị agha, azụgharịala ha irubere ọchịchị nkịtị isi. Ha kwụsikwara ike n'isi ịkwadọ ọchịchị ndị nkịtị."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43208185,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43208185,Ụkwụ Neymar rọjiri akụpụla ya n'asọmpi na-abịa,Neymar da Silva Santos bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Paris St-Germain agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid n'iko Champions League maka omerụrụ ahụ n'ụkwụ.,"PSG ji nde dọla nari abụọ zụ Neymar n'afọ 2017 Neymar dị afọ iri abụọ na isii merụrụ ahu n'ogweụkwụ n'ụbọchị ụka n'asọmpị Paris St-Germain na Marseille. Ndị dokinta ekwubeghị oge Neymar ga-agbake. Neymar ba otu PSG n'ọnwa August n'afọ 2017, o nyere goolu ruru iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ. Ugbua PSG ji akara iri anọ karị Monaco. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43552589,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43552589,Onye mere MMM: Ha gwuru m chacha ruru nde 3.7,Nwaafọ Naịjirịa mere MMM nke na-achọgị ka e kwuo aha ya ekwupụtala etu ya na atụmatụ pọnzi bụ MMM siri gaa n'afọ gara aga.,Ọtụtụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ tufuru ego ha site na atụmatụ MMM a. Ndị ụlọrụ Nigeria Deposit Insurance Corporation kwuru na ụmụ Naịjirịa soro na ya bụ atụmatụ riri nde atọ na ọma n'ọnụọgụgụ ebe ego furu oge MMM kwasara ruru ijeri 18. Akụkọ kwukwara na o nwere ndị nwere ọbara mgbalielu oge ọ kwasara maka ego ha niile ha mefuru. Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ihe kpatara ụmụ Naịjirịa jiri tinye aka na ụdị atụtmatụ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: mba-uba-44957021,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44957021,A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ,"Ndị ụlọikpe ukwu dị na Makurdi, Benue steeti ekpebiela ka a kwụgbuo mmadụ abụọ, Hartuna Idi na Suleiman Gina bụ ndị fọrọ na ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi rue oge ha nwụrụ maka ihe ha mere.","Ụlọikpe enyela iwu ka akwụgbu ndị omekome Cheta na ndị ntọọ mmadụ anọ gụnyere Saidu Abdullahi na Aliyu Garba tọrọ Fada Adeyi, onye Vika-Jenaraalụ ụka Katọlik n'Otukpo Dayosis, Benue steeti, gbuo ya ma tufuo ozu ya n'ime ugbo dị nso na Otukpo n'afọ 2016. Mana e mechara ndị uweojii nwuchie ha anọ, ha kwupụta na ha natara ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ otu nde naira na ụma(N1.7m) dịka ego isi ya mana ha gbagburu ya oge ha nụrụ na ndị obodo jikere ịbịa gbapụta ya ebe ha nwụchiri ya. Otu n'ime ha kwupụtara na ọ bụ ya gbara ya egbe gburu ya, ebe a mara mamdụ abụọ fọrọ n'ime ha ikpe ọnwụ taa bụ Wenezde. N'ozi ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ zigara ụlọakụkọ Daily Post, ha gosiri afọ ojuju na n'ikpeazụ, ikpenkwụmọtọ erutela ha aka. Mana ha tụrụ arịrị na mkpebi ahụ chetara ha ogbugbu n'ike e gburu Adeyi, onye bụ ọkammụta." afirika-49916777,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49916777,Tammy Abraham: Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa - Kanu Nwankwo,Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa,"Fikayo Tomori na Tammy Abraham Nke a bụ ihe Kanu Nwankwo nwere ikwu gbasara ọkpụkpọ ndị otu egwu bọọlụ nke mba Ịngland kpọrọ Tammy Abraham na Fikayo Tomori ka ha gbaara ha bọọlụ. Abraham na Tomori bụ ụmụ Naịjirịa. Ha na-agbara otu egwu bọọlụ Chelsea. Ha agbaarala Ịngland bọọlụ n'ogoogo ndị erubeghi afọ 21. Onye nkuzi bọọlụ nke mba Ịngland bụ Gareth Southgate kpọrọ Abraham na Tomori ka ha soro gbaa bọọlụ mgbe Ịngland ga-ezute mba Chek Rịpọblik n'ọnwa Ọktoba a. Nke a pụtara na ha abụọ agaghị enwe ike ịgbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ. Mana Kanu Nwankwo kwuru na nke ahụ enweghị ihe o mere. Nwankwo Kanu mgbe ọ ka nọ n'egwu. Dịka o si gwa ụlọọrụ ntaakụkọ Goal.com, Nwankwo kwuru na Naịjiria nwere ndị bọọlụ ọka nkụ. ""Anyị agaghị arịọ onye ọbụla arịọ ka ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ."" ""Ọbụ ndị mmadụ kwesịrị ịrịọ ka ha gbaara Naịjirịa bọọlụ."" ""Naịjirịa nwere ndị ma agba bọọlụ ọka nkụ."" ""Ndị anyị nwere ga-ezu inye anyị mmeri n'asọmpi ọbụla."" Ịngland ga-ezute Chek Rịpọblik n'abali iri na otu. Naịjirịa na Brazil ga-ezute n'asọmpi enyi na enyi n'abalị iri na atọ nke ọnwa Ọktoba. Lee etu mba Kenya si ebuso nrụrụaka agha Akwụkwọ ego 1000 shillings nke Kenya Gọọmentị Kenya ekwuola na atụmatụ ha wepụtara iji wepụ akwụkwọ ego ochie otu puku shilling maka iji gbochie nrụrụaka, gara nke ọma. Ha kwuru na ihe ruru mmadụ pasentị iri itoolu na asaa eweghachila nke ha, nke pụtara na onye ọbụla ka ji akwụkwọ ego otu puku shilling nke ochie ugbua, jizi akwụkwọ nkịtị. ""Anyị agaghị ekwe nkwa anyị agaghị emezunwu"" Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti agaghị ekwe nkwa ha agaghị emezunwu. O kwuru nke a ebe ọ na-arịọ ka ndị ọru nabata atụmatụ gọọmentị wepụtere iji tinye ego n'ụgwo ọnwa. Ngige sị na atụmatụ ahụ dị mma maka ha mefee oke, ọ bata n'ịchụ ndị mmadụ n'ọrụ. Nke a na-abịa dịka otu NLC bụ ndị na-elekọta ndị ọrụ na-akwado ịgba abụbụ ọrụ n'izu abụọ na-abịa. President Cyril Ramaphosa meet President Muhammadu Buhari Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola ihe gọọmentị ya bu n'uche maka ụmụ Naịjirịa bi na mba ahụ. O kwuru na ọ ga-anwa ike ya niile iji hụ na mwakpo Xenophobia ga-abịa na njedebe. Okwu ya nke a sị na mkparịtaụka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ntaakụkọ nwere na Pretoria n'ụbọchị Tọzde. Okwu ụgha na Facebook Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị Facebook amalitela iwepu akara ndị ha sị na ekesa asị na intanetị, ọkachasi ndị nọ na United Arab Emirates, Ijipt nakwa Naịjirịa. Facebook sị na akara ndị ha wepụru bu nke ndị mmadụ hiwere iji na-aghọrị ndị mmadụ site na-ikesasị akụkọ ụgha. Na mba ofesi Onyeisiala mba Cameroon bụ Paul Biya enyeela iwu ka atọghapụ mmadụ nari atọ na iri atọ no n'ụlọ mkpọrọ. Ndị a atọghapụrụ so n'ime ndị si mpaghara ọdịda anyanwụ mba ahụ eji maka ọgbaghara metutara mwereonwe ha. N'Egwuregwu, Chukwuebuka Enekwechi abụrụla onye Naịjirịa mbụ ruru agba nke ikpeazu na asọmụnpị ịtụ ọkpụ okwute Bekee kpọrọ ""shot put"". Enekwechi tụtara centimetre iri abụọ na ọma iji tozue n'asọmpị IAAF a na-agba na Qatar. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45157199,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45157199,Akụkọ dị mkpa mere taa: Ndi bu egbe agbagbuola otu onye ndu APC,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a,"Ụzụ akwa na-atụ n'ekiti steeti ugbua ebe ndi bu egbe gbatgburu otu onye ndu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC n'ekiti steeti. Bunmi Ojo bụ nwoke a gbagburu bụ bụ onye enyemaka Gọvanọ chiburu Ekiti steeti bụ Segun Oni. Ọzọ, A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti Ndị uweojii na Benue steeti ekwuola na ndị abanyị di egwu egbuola ihe ruru mmadụ asatọ n'obodo Tse-ujoh dị n'okpuru ọchịchị Katsina-Ala na steeti ahụ. Ha kwukwara na n'ime mmadụ abụọ ebugara ụlọọgwụ n'otu n'ime ha nwụrụ ebe nke ọzọ n'anata ọgwụgwọ. Na mba ofesi, Ndị uweojii na-atụ anya na otu nwoke anwụọla n'obodo Seattle mgbe ụbọelu o zuoro daturu n'ike mgbe a na-achụ ya ọsọ. Nwoke ahụ amabeghị aha ya si n'ọdọugboelu Seattle-Tacoma zuru ụgbọelu ahụ mmadụ anọghị n'ime ya. N'egwuregwu, Aha ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ aha Delle Alli onye ọgba bọọlụ otu Tottenham Hotspurs. Nke a bụ maka ọkpụ goolu ikpeazu o nyere nwetara ndị Tottenham mmeri nakwa nturugo o ritere na ngwụcha asọmpị dị n'etiti otu ya na Newcastle United. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị" afirika-47928989,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47928989,End Sars: E kwesịrị imechi Sars kpam kpam - Segun Awosanya,"Segun Awosanya bụ ọnụ na-ekwu maka ọdịmma ọha kwuru na iwu hiwere SARS ataala nchara nke bụ na o kwesiri ịgbanwe nke taa, nke echi.","Awosanya onye a ma ama dịka ""SEGAlink""sị na ọ bụghị ọrụ ndị SARS ịchụgharị ụmụnwaanyị yi akwa masiri ha maọbụ ụmụnwoke bu dada. Na ọrụ ha bụ naanị ibuso ndị oji egbe ezu agha. O kwukwara na iwu hiwere Sars emeghị ya ka ọ kwanyere ikike dịrị onye ugwu. Gee ihe o kwuru n'uju:" afirika-51971771,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51971771,Coronavirus cure - Ihe ndị ị kwesịrị ịmata tupu ịṅụọ ọgwụ chloroquine,"Tupu ị ga zụrụ ọgwụ chloroquine ṅụwa maka ọrịa coronavirus, lekwa ihe ikwesiri ịma ka ị ghara ịkwa m gara mara.","Chloroquine abụghị anụ oriri nwata ji egwuri egwu, ya mere kpachapụ anya. Ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ 'Food and Drug Administration' nke mba Amerịka enyela ikike ka a malite inye ndị nwere coronavirus chloroquine.' Ọ bụkwa eziokwu na ụlọọrụ 'National Agency for Food and Drug Administration and Control' nke Naịjirịa amalitela itule ọgwụ a, mana ọ pụtaghị na onye ọbụla nwere ịga zụrụ ya ṅụwa. Ihe ọghọm dị na chloroquine Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus? Cheta na a machiri chloroquine maka iji ya agwọ ọrịa malaria na Naịjirịa. Cholroquine bụ oke ọgwụ nwere ike imebi ihe n'ahụ mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ akpachaghị anya. Chloroquine nwere ike ịkpata ihe ndịa: Ihe dọkịta gị kwesịrị ịma tupu o nye gị chloroquine Ọ bụrụ na ọ dị nnọọ mkpa na ị ga-aṅụrịrị ọgwụ chloroquine, gbaa mbọ mee ka dọkịta gị mara ihe ndị a tupu ọ sị gị ṅụọ maọbụ aṅụla: Chloroquine a na-agwọ coronavirus? Chloroquine Ọgwụ 'chloroquine' abụrụla ahịa iwu ugbua n'ihi akụkọ na ya bụ ọrịa na-agwọ coronavirus. Na mgbede ụbọchị Tọzde, onyeisiala mba Amerịka kwuru na ngalaba 'Food and Drug Administration' enyela nkwado ka e were 'chloroquine' na-agwọ ndị nwere coronavirus. O kwuru na nnyocha gosiri na ọgwụ ahụ rụrụ ọrụ n'ahụ ndị e nyere ya. Ọtụtụ ndị kwukwara n'onyonyoo TV na na ụfọdụ ndị bu coronavirus ṅụrụ 'chloroquine' ma dị mma. Mana ụlọọrụ FDA wepụtara akwụkwọ ozi wee kwuo na ha enyeghị nkwado ọbụla maka iji ọgwụ ọbụla agwọ coronavirus. Ha kwuru sị: ""Onwebeghi ọgwụ maọbụ ọgwụgwọ ọbụla anyị kwadoro maka ịgwọ coronavirus."" ""Mana anyị nwere usoro ọgwụgwọ dị icheiche anyị kwadoro maka iji eleta ndị ọrịa."" Gịnị bụ chloroquine Chloroquine bụ ọrịa e jibu agwọ malarịa nke anwụ nta na-akpata Chloroquine bụ ọgwụ ejibu agwọ ọrịa ịba nke Bekee kpọrọ Malaria. Mana e mechara otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kwuo na ọ naghịzi arụ ọrụ ịgwọ ịba. Ya mere e ji machie ya na Naịjirịa maka ndị nwere 'malaria'. Ihe e ji mara chloroquine Chloroquine na-akọ ọtụtụ mmadụ ọkọ Otu ihe e ji mara chloroquine bụ na ọ na-akọ ọkọ. Mana ọbụghị mmadụ niile ka ọ na-akọ ọkọ. Ndị ọkacha mara kwukwara na ọgwụ ahụ na-enye nsogbu n'anya ma mmadụ ṅụtee ya aka. Ọ na-atakwa afọ, na-ebu ajụ, na-asa afọ, na-awa isi, na-afụkwa ụfụ n'ọkpụkpụ. Mana ọbụghị mmadụ niile ka ihe ndị a ga-eme. Etu e si aṅụ chloroquine Aṅụkwala ọgwụ na-abụghị dọkịta sị gị ṅụọ Ndị ọkacha mara kwuru na ọdịghị mma ịga zụrụ choloroquine na-aṅụ. Ọ ga-abụrịrị dọkịta nyere gwara gị zụta ya bụ ọgwụ tupu ịṅụwa ya. Ọbụghị naanị chloroquine, ọdịghị mma ịga zụrụ ọgwụ ṅụwa na-ebughị ụzọ gaa ka dọkịta nyochaa gi ahụ, mata ihe na-arịa gị, ma mara ọgwụ ọ ga-enye gị. Ọ bụrụ na i so na ndị gbaara ga zụrụ chloroquine, wepụkwa aka enwe n'ofe. Onyeisi Ụka Katọlik na Legọs bụ Achịbishọp Adewale Martins enyela ndị ụkọchụkwụ na Legọs ntụziaka ka ha na-edo ofufe nro naanị mmadụ iri ise nọ na ya. O nyekwara ndị ahụ adịghị, ụmụnwaanyị di ime, ndị ahụ adịghị ikike ịhapụ ịga ụka ụbọchị ruo otu ọnwa. N'akwụkwọ ozi o wepụtara, Adewale gwara ndị ukọchukwu ka ha nye ndị ọrụ akụike ohere n'ụlọụka ikụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi chekwa ọnwa ha . Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na na gọọmentị etinyeghị uchu na ichekwa agbata Naijiria na ndị mba ọzọ nakwa ihe gbara ụgbọ nje ọha iji gbochie nkesa ọrịa ọjọ. Nke a na-eme dịka gọọmenti Lagọs nyere ndị ụka ndụmọd ikwusị ọgbakọ ha iji gbochie nkesa Coronavirus. WAEC akwụsịtụla nhazi ule ha Ụlọọrụ ule bụ West African Examination Council (WAEC) asịla ụmụakwụkwọ Sekọndịrị ka ha cheretu n'ule ha na-akwado ile n'ọnwa Mee-Juun. Nke a bụ n'ihi ọrịa coronavirus na-arị ibe ya elu n'Afrịka nakwa ụwa niile gbaa gburu gburu ka akwụsịtụ nhazi ule a. N'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ E. K Myers wepụtara, ọ sị na nke a ga-adị ruo mgbe coronavirus belatara na mpaghara ndị a. Cheta na ụmụakwụkwọ sekọndịrị na-ele ule a n'ọnwa Mee ruo Juun nke afọ ọbụla iji pụta n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Ichekwa Naịjirịa site na coronavirus kachasị m mkpa - Buhari Onyeisiala Buhari ekwuola na ichekwa ndị Naịjirịa site n'ọrịa coronavirus bụ mbọ kachasị mkpa ọchịchị ya na-agba ugbua. O kwuru nke a n'akara twitter ya dịka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa katọrọ etu o si gbaa nkịtị kamgbe ọrịa batara Naịjirịa. Buhari sị na o kwenyesiri ike na ndị ọrụ ahụike dị iche iche nọ n'ọchịchị ya nakwa ndị ọrụ ọtawaike banyere coronavirus o hiwere na nso nso a. Akụkọ ọhụrụ banyere coronavirus na Naịjirịa Mịnịstrị ahụike na Naịjirịa sị na ha na-eme nnyocha ịchọpụta etu otu onye Naịjirịa na-emebeghi njem n'ime ọnwa abụọ si bute ọrịa coronavirus. Mịnịsta ahụike bụ Osagie Ehanire sị na Naịjirịa etinyela mba Austria na Sweden na mba ndị ha machiri maka ọrịa a. Ehanire sị na mmadụ iri na otu ahụ bu ya na Naịjirịa bụ ndị si na mba ofesi bata nakwa na ọ bụghị na Legọs ka e kwuru maka ya. O kwuru na mmechi e mechiri ọdọụgbọelu atọ (Enugwu, Pọtakọt na Kano) na Naịjirịa bụ iji kee nkwụcha banyere ọrịa a. WHO asịghị ka a ṅụọ Chloroquine maka mgbochi coronavirus Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control ekwuola na ụlọahụike mbaụwa bụ World Health Organisation akwadobeghị ka a ṅụọ ọgwụ chloroquine maka mgbochi coronavirus. Ha depụtara nke a n'akara twitter ha dịka ọtụtụ ndị mmadụ malitere itule ọkwa maka akụkọ si mba Amerịka pụta. 'Coronavirus' egbuola Aurlus Mabele onye Kongo na-eti egwu na Fransị Nwafọ Kongo na-eti egwu bụ Aurlus Mabele anwụọla n'ụlọọgwụ dị na Paris isi obodo Fransị dịka ọ gbara afọ iri isii na asaa. Akụkọ na-efegharị na soshal midia sị na ọ bụ coronavirus gburu ya mana a chọpụtaghị ma ọ bụ eziokwu. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Coronavirus In Nigeria: Gọvanọ Abia efughị efu nke o ji atọ atọ n'Amerịka - Ọnụ na-ekwuchitere Ikpeazu Ọnụ na-ekwuru gọọmenti Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na okwu na-efegharị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu furu efu maọbụ tọrọ atọ na mba Amerịka bụ okpotokpo asị. Mgbe BBC Igbo gwara ya na ha chọrọ inụ olu gọvanọ Ikpeazu, o kwuru na ọ ga -agwa ụwa okwu gbasara etu steeti ahụ si eme ihe niile ha nwere ike imee iji hụ na ha busoro ọrịa coronavirus agha. N'okwu ya, gọvanọ Ikpeazu nọ na Naịjirịa, ọ nọghị na mba Amerịka. California akpọchiela kpam kpam Steeti California akpọchiela kpam kpam dịka ndị ọchịchị na-agbalị igbochi mgbasa ọrịa coronavirus. California bụ steeti kachasị na mba Amerịka Mmadụ 14,000 ebutela coronavirus n'Amerịka. 900 n'ime ha bụ ndị California. Na Saụt Afrịka Beitbridge bụ okeala Saụt Afrịka na Zimbabwe Gọọmentị mba Saut Afrịka ekwuola na ha ga-arụ ogige n'oke ala ha na mba Zimbabwe. Nke a bụ iji gbochie ndị bu ọrịa coronavirus na ndị mbịarambịara ekwesịghị ekwesị ịbata na mba ha. Mikel Obi Mikel Obi ekwuola na ya agaghị alaghachi otu egwuregwu bọọlụ Trabzonspor ọzọ. Obi adịghị Mikel mma etu Trabzonspor si kpaso ya agwa maka na o kwuru ka akwụsị asọmpi bọọlụ n'ihi coronavirus. Ugbua Mikel alaghachila mba Ịngland ebe ya na ezinụlọ ya bi." 54599883,https://www.bbc.com/igbo/54599883,Onye bụ Ugo SARS ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'Enugu?,"Dịka ndị ntorobịa ka na-eme ngagharịiwe na Naịjirịa gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii, ọ kachcasị ndị ngalaba 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS), ụfọdụ ndị bi n'Enugwu kpụkwa onye ọzọ a kpọrọ 'Ugo SARS', n'ọnụ.","BBC ka na-agba mbọ ịchọpụta ma ebubo niile ahụ abụcha eziokwu. Onye bụ Ugo SARS? BBC ji onyonyo ndị mmadụ na-etinye na soshal midia wee mee nnyocha na ịntaneetị. Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na-akpọ Ugo Sars aha banyere okwu a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa ugbua, bụ mkpagbu na mmekpa ahụ n'aka ndị uweojii, mana e nweghị onye n'ime ha wepụtara ihe akaebe iji gosi na o mere ihe ndị ahụ n'ezie. Kama ụfọdụ kwukwara na ha ma Ugo Sars dịka ezigbo onye uweojii. lỤlọọrụ ntaakụkọ Vanguard dere akụkọ na-akọwa na ọ bụ ebubo ụgha ka ndị mmadụ na-ebo Ugochukwu Ozoude na ndị otu ya. N'ime akụkọ ahụ, mmadụ abụọ - Obiora Anichukwu na Emeka Ifedi - kọwara Ugo SARS dịka onyeuweojii kwụbara aka ya ọtọ ma na-arụ ọrụ ya nke ọma. Mgbe BBC kpọrọ Ugochukwu Ozoude, o kwuru na ebubo niile ahụ bụ asị, mana dịka onye uweojii, onweghi ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu, ọ bụ ndị isi ha ka ọ dị n'aka ime nke a. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugu steeti bụ, Daniel Ndukwe, azaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị, maọbụ zaghachi ozi anyị zigaara ya." afirika-44484306,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44484306,Nne Shekau: Ahụbeghị nwa m kemgbe afọ 15,"Na mkparịtaụka mbụ ya na onye ntaakụkọ na-enwe, Falmata Abubakar gwara ụlọọrụ akụkọ ""Voice of America"" na ya amaghị ebe Shekau nọ maọbụ ọnọdụ ya.","Oteela ndi agha Naijirịa ji achọ Shekau ""Amaghị ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. naanị Chukwu ma. Ahụbeghị ya kemgbe afọ iri na ise."" Nne Shekau kwuru na onyeisi ndị otu oyi egwu bụ Boko Haram hapụrụ Maiduguri, isiobodo Borno steeti, oge ọ ka bụ nwata dịka ""almajiri"" - nwata na-achọ ị mụta nkuzi alakọba. A mara Shekau dịka onye ndu otu kparala mkpamkpa ma gbuo puku kwuru puku ndị mmadụ na Naijiria, Kamerun, Chad na Nijia. Shekau e jirila aka ya gbuo Otụtụ mmadụ ngụnyere ndị so n'otu ya. O mebikwara ọtụtụ obodo ma laa ọtụtụ ndụ n'iyi na mpaghatra ọdịda anyanwụ ugwu Naijiria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53356312,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53356312,Ballet Dancer: Lee nwata nwoke ji egwu 'Ballet' gbakasịa soshal midia,Nwata nwoke a na-akpọ Madu Mmesoma Anthony na-agba egwu mkpịsị ụkwụ kọwara ihe kpalitere mmụọ ya igba ụdị egwu ahụ.,"Mmesoma sị na ịgba egwu masịrị ya nke ọma na ọ bụ ya mere o ji tinye anya n'ịgba egwu. Nke ọzọ bụrụ na ọ chọrọ igosi ụwa na ọbụghị naanị ụmụnwaanyị ka a hụrụ kwaa isi okpu n'ịgba egwu 'ballet'. Ọ sị na ọ na-agba egwu a na ọ na-adị ya ka ebe ọ na-arọ nrọ ọma. Nne ya bụ Madu Ifeoma kwadoro ya site n'itinye ya n'ebe a na-amụ etu e si agba egwu mkpịsị ụkwụ a bụ 'ballet'. Kirie ihe ha kwuru n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ: Grace Ekpu, Jessica Nwankwo na Nnamdi Agbanelo" egwuregwu-43468716,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43468716,Iwobi erutela ogige ndị Super Eagles na Poland,Nwaamadị na-agbara Arsenal bọọlụ bụ Alex Iwobi esorola na ndị mbụ batara n'ogige ndị Super Eagles ka ha na-akwado ịsọ mpi nke enyi na enyi maka nkwado iko mbaụwa.,"Alex Iwobi bụ nwa nwanne onye gbabuuru Super Eagles bọọlụ bụ Austin Jay Jay Okocha Cheta na Naịjirịa na Poland ga-agba bọọlụ ha n'ubọchị Fraịde na-abịa n'ọdọ bọọlụ Municipal dị n'obodo Wroclaw nke dị na Poland. Na Twitter, akara ndi Super Eagles nabatara Iwobi: End of Twitter post, 1 William Troost-Ekong, Alex Iwobi, Ola Aina, Tyronne Ebuehi, Brian Idowu na Leon Balogun so na ndị nọ na ogige ugbua. A na-ele anya na ndị ọzo ga-abata tupu o ruo ehihie Tuesde. Ndi ọzọ ga-eso n'asọmpị a bụ : Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47332585,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47332585,Fifa amachiela Chelsea maka izu ndị egwu bọọlụ na-etoghị eto,Fifa amachiela otu egwu bọọlụ Chelsea ịzụ ndị egwu were ruo afọ 2020 maka ịda iwu gbasara etu ha si emeso ndị egwu bọọlụ na-eto eto.,"Bertrand Traore nyere goolu anọ na asọmpi 16 o soro Chelsea gbaa A dakwara ha nha paụnds 460,000, ebe a dara ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bụ 'Football Association' paụnds 390,000. Ntaramahụhụ na-eme dịka fifa nyochachara ọzụzụ Chelsea zụụ ndị egwu bọọlụ ndị mba ọzọ erubeghị afọ iri na asatọ ndị gụnyere, Bertrand Traore. Fifa kwuru na Chelsea gbajọrọ iwu ha ụgboro 29. N'afọ 2017, otu ụlọọrụ akụkọ intanet a kpọrọ 'Mediapart' gbara n'anwụ na Chelsea na-ewe ndị egwuregwu etorubeghị afọ 18 n'ọrụ. Akụkọ ga-amasị:" 44036599,https://www.bbc.com/igbo/44036599,Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine,"Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu.","Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara. N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ. ""N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd . Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke."" Nafdac na-eme nyocha ndịa maka nchọpụta BBC mere gbasara ọgwụ ahụ Adeyeye kwukwara na imepe ụlọọrụ ndị a ga-agbado ụkwụ ka ụlọọrụ ndị a si nye Nafac nkwado na nyocha ha. O kwuru na otu Nafdac nke gụnyere ndị ọrụ itoolu; abụọ bụ ndị na-enyocha ọgwụ na asaa bụ ndị nchọpụta n-ahụ maka idewe iwu na ndị uweojii iri gara Ilorin n'ụbọchị ahụ, ị ga mee nyocha ụlọọrụ abụọ e nyere ikike ime ọgwụ ụkwara nwere codeine, ndị a kpọrọ aha n'akụkọ nyocha nke BBC wepụtara. Dika Adeyeye siri kwuo, otu ndị ahụ bụkwa ndị e zigara n'ụlọọrụ Emzor na Lagos. O kwuru: ""Isi ozi e zigara ha bụ ị ga lele akwụkwọ oriri na nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine nye ndị na-aṅụ ya."" O kwuru na Nafdac akpọọla oku nzụkọ ndị ihe gbasara ọgwụ metụtara. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43355716,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43355716,Gọọmenti etiti ewetuola mbubata osikapa rue pasenti 90,Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari nọrọ na Jos dị na Plateau steeti ụnyaahụ bụ ụbọchị 9 ọnwa Maachị kwuo na ya ga-ewetu mbubata osikapa n'ala Naịjirịa rue pasenti iri itoolu.,"Osikapa bụ nri a na-enweta n'ezinaụlọ niile na Naịjirịa Ọ kọwara na a ga-eji ego enwetara na ya kwado ọrụugbo, nye ndị ntorobịa ọrụ nakwa ịnapụta Naịjirịa n'ime ọnọdụ ida mba ya. Onyeisiala Buhari kwuru nke a oge ọ gara isiobodo Plateau steeti bụ Jos imepere igwe trakịtọ narị anọ e wepụtara maka ịrụ ọrụugbo. N'okwu ya: ""Gọọmenti ga-ewetu ibubata osikapa rue pasenti iri itoolu na Naịjirịa ma jiri ego ya tinye n'ikwalite ọrụugbo iji nye ndị ntorobịa ọrụ."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Cheta na o teela aka gọọmenti Buhari na-ekwu na ha ga-amachi ibubata osikapa na Naịjiria kpamkpam n'afọ a. Nke a ebutala ndọrịtaụka n'akụkụ dị iche iche, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ ga-ebute agụụ maka na Naịjirịa etozubeghi ịkọpụta osikapa ga-ezu mmadụ niile." media-50903506,https://www.bbc.com/igbo/media-50903506,Ọgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa,"Ihe ọdachị mmadụ nwere, nwereike ibụ ngozi nye ya.",Nke a bụ akụkọ Prince Uche hapụrụ ọrụ ọkaiwu ya rụwa dụa dụa n'Aba. Ị ga-amụta ọtụtụ ihe n'ime akụkọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-43878779,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43878779,Ajujụ Chimamanda jụrụ Hillary ebulitela okwu feminizim ọzọ,"Feminizim na-ewu na Naịjirịa ka akụkọ pụtara na onye ode akwụkwọ ama ama bụ Chimamanda Adichie jụrụ Hillary Clinton, bụ onye zọbụrụ ọchịchị ka onyeisiala mba Amerịka, ihe kpatara ojiri ""nwunye"" bido ikọwa onwe ya na akara ya Twitter, ebe di ya bụ Bill Clinton emeghi etu a.","Adichie bụ onye na-agba mbo ihu na nwoke na nwaanyị nọ nhatanha Hillary Clinton sara Adichie, were si ya ""maka etu i jiri jụ ya bụ ajụjụ, a ga m atụghari etu m siri dey nkọwa onwe m n'akara Twitter."" Mana ebe Adichie na Clinton jiri okwu mee ihe ha ji mkparita ụka enyi na enyi, soshal midia Naịjirịa enwụrụọla ọkụ ka ndi mmadu na-etinye ọnụ na-ajụ ihe kpatara nwaada ahụ jiri jụọ ụdịrị ajụjụ ahụ, maọbụ ihe mere ojiri kwesi ịjụ ya. Hillary Clinton bụ onye ama ama maka nkwalite ụmụ nwaanyị Hillary Clinton bụ onye ihe metụtara umum nwaanyị na amasị nke ukwuu. Etu ka Chimamanda Adichie jirikwa bụrụ onye ama ama dika onye kwenyere na nwoke na nwaanyị kwesiri ihatanha. Ihe bụ ihe o metụrụ ọnụ mgbe ya na BBC Igbo nwere Mkparịta ụka n'afọ a. Chimamanda akọwapụtala onye ""feministị"" bụ Ọdịzị ka ọ bụ akara ""feminist"" a ejiri mara Adichie mere ndi mmadụ jiri agbaka ahụ ma ya kwuo okwu ha na-ero na-osenyeghị n'ihe dị ha n'ụche. Agbanyeghị na onye ajụru ajụjụ egosịghị iwe maọbu mgbaka ahụ banyere ajụjụ Adichie jụrụ, ụfọdụ ndị Naịjirịra jiri ya bụ okwu mere ọgụ. Otu onye nwere akara @GreatGracious sị kama nwaada Igbo ga etinye isi an akwụkwọ ọ na-edere anyị, ọ nọ na-ekwu maka etu Hillary jiri kọwa onwe ya. @KathleenNdongmo wetere n'okwu a, na-asi na okwu Adịchị amasighị ya, Ka @AyoShonaiya na-akọwa na agbanyeghi na ya na-akwụ Adichie n'azụ, ajuju ya a adabachaghị. Onwekwere ndị rụtụrụ aka na Barrak Obama dere na ya bụ nna n'akara Twitter ya. Mana, onwere ndị ọzọ na-akwadọ ihe Adichie kwuru: @Uduakisong na ajụ ndị na ewe iwe ihe mere ha jiri na-ewe iwe make iwe onye ọzọ were? @MakiSpoke dere na ọtụtụ na ndị na-aba mba na Twitter ekiribeghị mkaprịta uka Adịchịe na Hillary nwere. Ka @damola_ososanya na-akọwa na ụmụ okorọbịa na Twitter aghọtaghị ihe mkparịta ụka Hillary na Chimamanda pụtara. Mana, nke kachasị n'okwu a bụ na Hillary Clinton kwetere na ya ga-edegharị nkọwa akara ya na Twitter maka ihe Chimamanda kwuru. Nke bụ, ka ndi mmadụ na adọkachasị onwe ya, nwaada a nọzị n'ọnọdụ onye tụgharị ụche nnụkwụ mmanwụ dịka Hillary Clinton, ma ya bụrụ na o me ka o si kwu. Na ikpeazu, cheta na ọgbughị ta ka o bidoro, nne ya ochie bụ onye kwenyere na nwoke na nwaanyị kwesịrị ịnọ nhatanha, ihe ka o kwuru bụ ""feminizim"". Gee ya ntị ebe a: Chimamanda bụ onye odeakwụkwọ a ma ama na mbaụwa" afirika-43207885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43207885,Dapchi: Ndị agha na ndị uweojii enwela nghọtaghi,Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa na-arụ ụka maka etu esi hazie nchekwa na Dapchi bụ ebe ndị ntọọ tọọrọ ụmụakwụkwọ na izu ụka gara aga.,"Ndị nwe ụmụakwụkwọ Boko Haram nwụchịkọrọ sị na ndi na-efu dị mmadụ otu nari na ise. Ụnyahụ, ka ndị agha Naịjirịa zipụrụ ozi na ha lanyere ndị uweojii nchekwa obodo Dapchi mgbe ha wepụrụ ndị agha na echekwa obodo ahụ, ndị uweojii gọnariri ha. Sumonu Abdulmaliki, bụ onyeisi ndị uweojii na Yobe steeti, zipụrụ ozi nke ya, na-ekwu na onweghị mgbe ndị agha gwara ha na na ha na ewpụ ndị agha nọ ọrụ nchekwa na Dapchi. ""Ọ okwu asi na okwu na-agbagwojuanya ka ndị agha kwuru. Onweghi mgbe ha lanyere anyị ebe nchekwa ha,"" Abdulmaliki kwuru. Cheta na ntọrọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ a na Dapchi bụ ọzọ na akpam ike a na-ebo ndị Boko Haram kemgbe ha tọọrọ ụmụakwụkwọ na Chibok n'afọ 2014. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53706156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53706156,"World Indigenous Day: Ihe mere Awka, Enugu,Umuahịa na obodo ndị ọzọ ji bụrụ isi obodo",E nwere ọtụtụ obodo dị n'ala Igbo ma ha niile nwere akụkọ etu ha siri bido.,"Kama ihe ị kwesiri ịma maka etu obodo siri bido bụ na ọ dị ụzo abụọ. Otu bụ nke ndị ụlọakwụkwọ na ọkammụta ndị na-ahụ maka ihe mere mgbe gboo nke bekee na-akpọ history ha nyoputere. Nke abụọ bụ akụkọ ndị obodo na-akọ bụ etu ha siri bido nke enwereike ịkpọ 'oral history.' Ọ dị mkpa ka onye ọbụla chọrọ ịma etu obodo siri bido mara na-enweghị ebe edere ya ede nke mere na nghọtaghe na adịkarị. Ọ bụ ọkammụta abụọ ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara akụkọ ihe mere ndị Igbo bụ Ọkammụta Chigozie Nnabuihe na Ọkammụta Akex Ugwuja tinyere ọnụ n'akụkọ a. Akụkọ mere etu Asaba siri bido Nnabuihe kọwara na ndị Igbo emeela njem oge gboo gaa ebe a na-akpọ mpaghara Savana nke mechara bụrụ Sahara ma siri ya gaa mba Ijipt. Ọ kọwara na ndị Igbo nọkwa n'ebe bụ Benin ugbu a tupu ndị Benin a bịa chụpụ ha. Dịka akwụkwọ mazị Dennis Osadebey dere nke ọ kpọrọ ""Building a Nation"", ọ kọrọ akụkọ ihe mere maka otu nwoke aha ya bụ Nnebisi. Nnebisi bụ nwa nwaanyị Nteje aha ya bụ Diaba onye lụrụ onye Igala aha ya bụ Ojobo. 'Anyị chere na anyị bịara ịnabata ndị enyi, anyị amaghị na ọ bụ ọnwụ anyị ka anyị na-agakwu' Ọ bụ mgbe a ndị obodo jụru ịnye Nnebisi oke ya na ọ bụghị onye Nteje. Nke a mere ka Nnebisi na ndị na-eso ya si Nteje pụọ were chọwa ala nke ha. Osadebey na-akọwa na njem Nnebisi dịka o duru ya site na Nsugbe ruo ebe mmiri Ọma Mbala na nke Niger zutere onwe ha. Ọ kọwara na Nnebisi na ndị otu ya gafere mmiri a were rute Ikpele Mmili (Cable Point). Ha kwụsịri ebe a were sị ka ha kọọ ubi n'ihi n'oge ọrụ ubi ka bidoro. Ihe ha kọrọ mere nke ọma nke mere ka ha birizie ebe ahụ. Nnebisi kpọrọ ebe a Ahaba. Kama Osadebey kọwara na ọ bụ onye Ukọchukwu si mba Itali aha ya bụ Carlo Zappa ma bụrụ kwa onye na-ese maapụ bụ onye dere aha obodo Ahaba dịka Asaba were zịgara ndị ọchịchị. Ihe mere eji mee Asaba isi Obodo Asaba bụ ebe ọzọ eji ịzụ ahịa mara mgbe gboo. A na-ere ihe dịka Akpụ, Ji, Mmanụ na Ọji n'Asaba. Ụmụaka Biafra: Etu ndị etobeghi ntoroọbịa jiri hụ agha Nke a mere ka ọ bụrụ isi ụloọrụ National African Company site n'afọ 1886 ruo afọ 1900. Asaba bụ kwa isi ụloọrụ ndị Royal Niger Company. Ọ bụ n'afọ 1991 ka e mere Asaba isi obodo Delta steeti. (Britannica) Akụkọ kọrọ etu Ụmụahịa siri bido Tawa n'Umuahia BBC Igbo jụrụ Mazi Timothy Nnochirionye Ohaka, onye bụ onye Umuahịa etu ya bụ aha siri gbanwee. Ohaka kwuru sị "" Ọ bụ mgbe ndị ọcha sị Obodo Bende abata ime Ibeku, ha rutere na-ebe a na-azụ ahịa were jụọ ndị mmadụ aha ebe ha nọ, a sara ha ""Ọma Ahịa"". Kama dịka o siri ha ike ikpọpụta ha kpọọ ya ""Ụmụahịa"". Mazị Ohaka kọwara na-enwere nnukwu ahịa na-azụ karị nke mere eji akpọ ya Ọma Ahịa. Igbo Language: Lee aha Igbo ndị mmadụ kpọrọ 'Graduate' Ọ kọwakwara na Ọma Ahịa a dị n'Ibeku ,ma sịkwa na obodo ndị mezuru umuahia ugbua gụnyere Olokoro,Ubakala, Ọhụhụ na Ibeku. Ọkammụta Akex Amaechi Ugwuja kọwara na-enweghị obodo bidoro dịka ụmụahịa kama ọ bụ ndị ọcha chịkọtara obodo ndị a ha kpọọ ya Ụmụahia. Ọ kọwara na mgbe arụrụ ụzọ ụgbọ oloko nke si Pọtakọtụ gawa Enugwu bidoro azụmahịa n'ọdọ ụgbọ oloko n'ụmụahịa na ebe a na-akpo Ibeku Junction. Ugwuja kwuru na ihe akpọburu ebe ahụ bụ ama ahịa maka ahịa nọ ebe ahụ. Igbo Origin: Aguleri na Nri na-azọ ndị bụ isi Igbo - Nke Ikpeazụ O kwuru sị ""ọtụtụ ndị obodo dịka Ibeku na ụmụọkpara ga-ekwu na ha furu efu site n'ala, kama anyị ma na mmadụ niile nwere ebe ha siri bịa"". Ugwuja gara n'ihu kwuo na dịka ndị ọkammụta na-ekwu na ndị obodo mejupụtara ụmụahịa dịka ụmụọkpara na Ibeku nwereike site na mbaghara Cross River na Qua Igbo River. Ọ kọwara sị ""obodo ndị a nke ndị ọkammụta na-akpo BEnde Culture nwereike ị bụ ndị sitere na mpaghara Cross River na mpaghara etiti Igbo were bịa"". Ihe mere eji mee Ụmụahịa isi Obodo Ụmụahịa bụ ebe dị mkpa maka azụmahịa oge ochie. Ugwuja kọwara na ihe kpatara ya bụ ọ bụ ọdọ ebe ụgbọ oloko si Enugwu a ga Port Harcourt na-akwụsị. Nke ana-enye ndị ahịa oghere ire ahịa ha ma tinye kwa ya n'ọgbọ oloko. Ụmụahịa bụ kwa isi obodo mgbe a na-alụ agha Biafra site n'ọnwa Seputemba afọ 1967 ruo ọnwa Disemba afọ 1969. Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo Akụkọ kọrọ etu Enugwu siri bido Gọọmentị Enugwu steeti na-akọwa na ndị mmadụ ebirila n'Enugwu kamgbe 6,000BC. Ha kọwara na ọ bụ ndị na-ahụ maka ụkpụrụ obodo gwuputara ihe gosiri nke a n'afọ 1978. (Enugu State Govt.) Ọkammụta Alex Amaechi Ugwuja kọwakwara na dịka ụmụahịa, na Enugwu bụ obodo dị iche iche mejupụtara ya. Kama anyị ga-etinye anya n'obodo Nike bụ ndị ala ha mwjupụtara ọtụtu ebe a na-akpo Enugwu taa. Ndụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ Obodo Nike Akwụkwọ Ngozika. A Obi-Ani dere nke ọ kpọrọ ""Intergroup Relations in Igboland: A study of Precolinial to 1908 Opi and Nike Communities"" kọwara ihe ọ chọpụtara na nyocha maka obodo Nike. Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ọ dere gụnyere : Ọ bu obodo na mpaghara di iche iche bịakọrọ were bụrụ obodo Nike Ọ bụ Obodo iri abụọ na anọ mejupụtara obodo Nike. Ha gụnyere Ibagwa Nike, Amakpo, Onyoho, Ama Owele, Eziama, Edem, Amorji, Nokpa, Alulu, Iji Nike, Ogui Nike, Nneke Uno, Nneke Odenigbo, Ugwogwo Nike, Ogbeke, Agbogazi, Ako, Emene, Akpuoga, Ugwuomu, Nchetenche, Onu-Ogba, Nkwubor na Obinagụ. Aha obodo Nike sitere na ""Ndị Ike"" dịka ndi agbataobi ha ha meriri n'agha na-akpọ ha. Ọ kọwara na mgbe gboo, Nwoke ọbụla amụrụ n'ụbọchi ahịa Eke na-abụ onye agha. Ndị Nike bụ ndị eji azụm ahịa mara, ihe ha na-agba mgbere ya bụ ohu, nnu na ihe ndị ọzọ. Ofalla ala Igbo Ha na ndị Nsukka na ndị Opi na-azụkọ ahịa nke ọma. Ihe mere eji mee ya isi Obodo A chọpụtara coal na otu Obodo mejupụtara Enugwu bụ Enugwu Ngwo n'afọ 1909 nke mere ka anya ndị ọcha nọrọ na ya bụ obodo. Enugwu bụ isi ọchịchị nke mpaghara ọwụwa anyanwụ site na'fọ 1939 ruo 1951 ma bụru kwa isi obodo nke mpaghara ọwụwa anyanwụ site n'afọ 1951 ruo afọ 1967. Enugwu bụkwaisi obodo mgbe agha Biafra site n'ọnwa Mei ruo ọktoba nke afọ 1967. Enugwu bụ kwa isi obodo Anambra steetri site n'afọ 1976 ruo afọ 1991. Ọ bụ n'afọ 1991 ka ekewapụtara Enugwu steeti nke isi obodo ya bụ Enugwu. ( Britannica) Akụkọ kọrọ etu Abakeleke siri bido Enweghị onye ma ebe ha siri bịa kama e chere na ọ bụ ndị Izii bụ ndị bu ụzo bịa. Ndị ọzọ kwa zitere Ezza,Ikwo,Ọnịcha na Ngbo bịara biri na Abakeleke. (Ebonyi state Gov.) Abakeleke bụ ihe akpọrọ ebe a mgbe ndị ọcha bịara. Ọ bụ ndị Izii kacha nwee ala na ebe a kpọrọ Abakeleke. Ugwuja kwuru na ha nwereike ịbụ ndị sitere na mpaghara Cross River, Benue na etiti Igbo mejupụtara ndị Izii. Ọ kwuru sị ""Abakeleke n'oge 1950 bụ isi obodo mpaghara Ogoja province n'ọwụwa anyanwụ"". Kama Ugwuja kwuru na ya emebegfhị nyocha nke ọma maka ndị obodo Abakeleke. Ihe mere eji mee Abakeleke isi Obodo Abakeleke oge gboo bụ obodo eji nri na-ịzụ ahịa nri were mara. Ala Abakeleke dị mma maka ọrụ ugbo. Ọ bụ n'afọ 1996 ka ekewapụtara Ebonyi steeti were mee Abakeleke isi obodo ya.(Ebonyi state Gov.) Akụkọ kọrọ etu obodo Ọka siri bido Ihe a bụ otu n'ime fly over dị n'Awka, Anambra steeti Ugwuja kọwara na ọ bụ Obodo iri atọ na atọ mejupụtara Ọka. E nwere mpaghara abụo dị n'Oka nke bụ Ifite Ọka na Ezi Ọka. O kwuru si ""Akụkọ na-ekwu na njem mbiri kacha dị mkpa bụ ndị sitere ugwuọba nke dị n'Enugwu steeti taa"". Ị nụla akụkọ maka Onyeama n'Eke onye mbụ wetara mmepe n'Enugwu? O kwuru na e nwekwara uọdụ ndi si Igala were bịa biri n'Ọka. Akụkọ etu Ọka siri bido bụ akụkọ maka ndị di iche iche sitere ebe dịkwa iche iche were biri n'Ọka. Ugwuja kwuru sị "" Ihe ndị mere ka ha nọkoọ ọnụ dịka obodo bụ akaọrụ ịkpụ ụzụ, ọgwụ ọdịnala na ọrụ aka"". Ọ kọwara na n'oge na adịghị anya, na ndị a niile bidoro hụwa onwe ha dịka ndị Ọka. O kwuru na ndi mmadụ dịka Okammụta Onwụkanjọ na-akọwa na ọrụ ikpụ ụzu sitere Enugwu steeti bata Ọka. Onye ọja Gerald Eze Ihe mere eji mee Ọka isi Obodo Eji ịkpụ ụzu were mara ndi ọka. Nke mere ka ọ bụrụ ebe ama ama n'ala Igbo. Ndị Ọka na-akọ ugbo nke ọma na-akọpụta ihe dịka Ji, Akpụ, Ọka na mmanụ nri. Ihe ọzọ mekwara Ọka ji bụru obodo ama ama bụ arụsị ha bụ Agballa nke a na-ahụta dịka Chukwu nke Arọchukwu. E mere ọka isi Obodo Anmabra steeti n'afọ 1991.(Britannica) Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45511886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45511886,A hapụla ndị dị ndụ tọrọwa ndị nwụrụ anwụ?,Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na ha anwụchiela mmadụ abụọ tọrọ ozu agadị nwaanyị a dọwara n'ụlọozu dị n'Imo steeti buru ya ga dọwa n'ime ọhịa.,"Ọ sị na ndị omekome ahụ sị ndị nwe ụlọọgwụ ebe a dọwara ozu nakwa ndị nwe ozu ka ha kwụọ puku nde narị naịra anọ tupu ha ebughachi ozu nwaanyị a. Enwerem kwuru na ihe tụrụ ha anya bụ na otu n'ime ndị omekome a ka sị n'ụlọ mkpọrọ pụta bụ ebe ọ nọrọla afọ iri na anọ maka ntọ. Onye nke ọzọ sị mkpọrọ afọ isii pụta maka mmerụaka ntọ. N'ọnụ ya, anyị amaghị ma onye a tọrọ maọbụ onye echiche maọbụ onye ọkwa ya gbalitere n'obodo tupu ọ nwuọ. Enwerem kwuru na dịka ọnwa ""mba"" bịarala nakwa ntuliaka na-abianụ n'afọ 2019 ya na ndị otu ya kere ezigbo nkwụcha ị chekwa ndị Imo steeti ma memina ndị omekome nwereike ị kpa mkpa mkpa ọbụla. Ndị uweojii si na ụdiri mpụ a tụrụ ha 'anya Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51528876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51528876,Imo State: Obodo Imerienwe ebe enwe na mmadụ bụ nwanne,Obodo Imerienwe dị n'okpuruọchịchị Ngọr Ọkpala Imo Steeti kọwara ihe jịkọtara ha na anụ enwe mere e ji kpọọ ha 'Imerienwe'.,"Ndị ichie abụọ gụnyere Eze Austin Uwadiegwu Ekechi na Nnadi Chiagorom Nkwocha kọwara etu ha si mara Imerienwe si malite. N'agbanyeghi na e nwere akụkọ dị iche iche banyere mmalite Imerienwe, nke bụ isiokwu bụ na ha anaghị eri enwe ruo taa. Kirie akụkọ n'uju Ndị mere ya bụ Ikechukwu Kalu, Vining Ogu na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46109367,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46109367,Ụmụ Obieze: Egwu anyị gbara Igbo gharị,Ụmụ Obieze bụ dimkpa ise ama na gburugburu ala Igbo maka egwu ha.,Ha ewuola na soshal midia dị icheiche maka egwu ha na-akpa ọchị. BBC Igbo zutere ha n'Oji River. Ngwa gee ihe ha gwara anyị n'uju. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo. afirika-44263473,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44263473,Ụlọikpe atụọla ndị ekweghịekwe na Kameroon mkpọrọ,Otu ụlọikpe dị na Kameroon amala mmadụ asaa so na ndị ekweghịekwe na mba ahu ikpe na ha bu ndị oyi egwu bụkwara ndị chọrọ nkewa.,"Mancho Bibixy tupu anwụchịe ya Ndị ihe a metụtara gụnyere Mancho Bibixy, bubu onye ntaakụkọ na radio na mpaghara Kameroon na-asụ Bekee, na mmadụ isii ọzọ. Ndị a ga anọ mkpọrọ site afọ iri rue afọ iri na ise. Ndị na-asụ Bekee na Kameroon bidoro emume ekweghịekwe n'afọ 2016 ka ha na-ekwu na ndị si na mpaghara Kameroon na-asụ Frenchị na-emekpa ha ahụ, ma na-egbọchịrị ha ụzọ ọganihu. Ekweghịekwe a mechara bụrụ ihe yiri agha, bukwa nke butere ogbugbu mmadụ. Mmadu puku na puku gbagara Naịjirịa ka ndị nchekwa Kameruun ji aka ike eso ndị a na-acho inwere onwe ya." afirika-55082678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55082678,'Ihe mere m jiri ntu ese ihe mara ezigbote mma',Onyinye Ezennia bụ ezigbote onye nka na eji ntu obele obele na owu ese ihe mara ezigbote mma.,"Dịka o siri kwuo, ọ na-eji ntu ruru 5000 ese eserese ya. Ọ sịkwa na ọ na-ewe ya ihe ruru izuụka abụọ iji mepụta otu nka. O kọwara na ihe mere o ji esakari ụmụnwaanyị bụ iji gbaa ụmụnwaanyị gabigara ihe mgbawa obi ume. Ọ na-eme ihe enweghị aha iji mee ka ndị mmadụ mata maka mgbanwe eluigwe. Akụkọ a si n'aka Chiemela Mgbeahuru" afirika-46817812,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46817812,"Ndị dọkịnta isi ekwuola na isimgbaka, abụghị mmụọ ọjọọ na-ebute ya","Ndị dọkịnta na ndị ọkachara mara ọrịa metụtara ụbụrụ nke Federal Neuro-Psychiatric Hospital na Yaba, Legos akpọọla oku ka ndị ọrụ ntaakụkọ na ndị na-eme ihe onyonyo na-etinye uche n'ụdị ozi ha na ewpụta banyere ọrịa isi.","Ha kwuru nke na ọgbakọ ha nwere n'ogige ha ụbọchị Tuzde. Dọkịnta Nworia Chukwudi kwuru na etu ndị ntakụkọ sị akọwa okwu ndị ọrịa isi na-eme ekwesịghị ekwesi n'ịhị na ọ na-eme ka a na asọ ndị ahụ asọ. N'otu aka ahụ, Dọkịnka Nwakire Chinwe kwuru na ọbụghị ezi okwu na-adịghị agwọ ara maọbụ ọrịa isi agwọ. Ha dọrọ ndị ihe nkiri Nollywood ọdụ ka ha na-eme nchọpụta tupu ha mee ihe nkiri Metụtara ndị na-arịa ọrịa ụburu iji gbanahụ iduhie ọha mmadụ." afirika-50909672,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50909672,"2019 Summary: Tacha, Cardi B, Ike Ekweremadu na ihe ndị ọzọ ị gaghị echefu maka afọ 2019","Dịka afọ 2019 na-abịa na nchịkọta, BBC Igbo na-echetara gị ihe ndị mere n'afọ ị na-agaghị akpọfu n'imi.","Site n'ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Disemba, ọtụtụ ihe mere bụ ihe wugidere ewu a jụwazịa ma ọ bụzị 'chi bọọ a nụ ọzọ'? Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ ebe a. 1) Mwakpo Ike Ekweremadu Ọ bụrụ na ị nụghị maka mwakpo a wakporo Ike Ekweremadụ bụ sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa n'ọnwa Ọgọstụ 2019, kedụzị ebe ị gara? N'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ ahụ, Ekweremadu gara ebe a kpọrọ ya oku pụrụ iche ka ọ bịa soro ndị Igbo rie ji ọhụrụ na mba Jamini, mana akụkọ dagharịrị ka ọ hụrụ onwe ya ebe ọ na-azọ isi onwe ya. Ndị Ipob pụtara sị na ọ bụ ha wakporo ma tie dimkpa nwoke ahụ ihe, tupu ndị uweojii mba Jamini akpọrọ ya pụọ ebe ahụ. Na e mechara wakpoo Rotimi Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem, ewurughi ka nke a. 2) Alụmdi na nwunye Regina Daniels N'ọnwa Mee nke afọ a ka akụkọ malitere ifegharị na Regina Daniels bụ ome ejije a ma ama na Nollywood lụrụ Ned Nwoko bụbu onye omeiwu nta. Kepu kepu a malitere mgbe Regina malitere itinye foto dị iche iche na-egosi ka ọ na-ekpori ndụ nakwa na-azụta ụgbọala nakwa ụlọ dị iche iche n'ime obere oge, n'elu soshal midia ya. Ndị mmadụ nọ na-ajụ ebe ego niile a si apụta, tupu ndị 'onyokomita' enyoputa na e nwere ihe jikọrọ ya na Nwoko. N'ọnwa Ọgọstụ ka Regina mechara pụta kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ lụọla Nwoko. 3) Okwu Busola Dakolo na Biodun Fatoyinbo: N'ụtụtụ ụbọchị 28 nke ọnwa Juun ka ndị Naịjirịa tetara ụra ịnụ na Busola Dakolo bụ nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo, na-ebo Biodun Fatoyinbo bụ ụkọchukwu ebubo ndina n'ike. E kwugidere okwu gbasara ebubo a makana Fatoyinbo bụ ụkọchukwu nnukwu ụlọụka a ma dịka Commonwealth of Zion Assembly (COZA). Ndị a ma ama na-ewu ewu pụtara kwuo ebe ha kwụ (ụfọdụ kwadoro Busola ebe ndị ọzọ kwadoro Fatoyinbo), ndị mmadụ mekwara ngagharịiwe, ebe Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naịjiria tinyekwara ọnụ. Busola mechara gbaa Fatoyinbo akwụkwọ n'ụlọikpe, nke ụlọikpe mechara kụpụ ka ha sị na ha ahụghị ihe mgbaama a ga-eji kpee ikpe a. 4) Super Eagles natara ọlanchara: N'ọnwa Julaị ka asọmpi Iko Mpaghara Afrịka nke afọ 2019 nwuru ka ọkụ; n'ime ọnwa ahụ ka Ọljiria bulikwaranụ iko ahụ. Mana Naịjiria agbaghị aka, makana ndị Super Eagles si n'ụkwụ Odion Ighalo mechara wụsa ọwa gbanye goolu nyere anyị ọlanchara maka ịbụ ndị nke atọ. Ighalo nwetakwara ihe nrite akpụkpọụkwụ ọlaedo maka ịbụ onye kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ. 5) Buhari ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ? Aisha Buhari anaghị ezokarị ọnụ n'ihe gbasara ọchịchị di ya. N'ọnwa Ọktoba ka akụkọ malitere ifegharị na Onyeisiala Muhammadu Buhari na-akwado ịlụkwasị Aisha nwunye ya nwaanyị ọhụrụ n'isi. Akụkọ ahụ kwukwara na ọ bụ Sadiya Farouq bụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mmadụ, ọrụ gbata gbata na mmekọrịta madụ na ibe ya, ka onyeisiala nọ na-akwado ịlụ. Mana Farouq pụtara kwuo na enweghi ihe ọbụla jikọrọ ya na onyeisiala. 6) A chụrụ Tacha ụkwụ eru ala na Big Brother: Emume Big Brother Naịja Pepper Dem nke ugboro anọ malitere n'ọnwa Mee, mana o wugidere ruo ọnwa Ọktoba ọ gwụrụ. N'ime owuwu ya ka mmadụ abụọ siri ike pụtara bụrụ ndị a na-akpụkarị n'ọnụ; Tacha maka ịgbasa ụfọdụ ndị mmadụ ọnụ ọjọo, nakwa Mercy maka egwu ọ na-agba nakwa ịbụ ihe ọ kpọrọ 'queen of highlights'. Ihe mere ha jizi wuo n'ụzọ pụrụiche bụ ụbọchị ha abụọ kụkọtara isi, kọọ ezigbo ọnụ gaara ebi n'ọgụ aka ma ọ bụrụ na e gbochighi ha. Nke a mere n'izu ikpeazụ ha n'ime ụlọ ahụ, mana nke ahụ akwụsịghị Big Brother inye Tacha ọsọ maka 'ikpalite Mercy'. Mercy mechara merie ma nweta ego nde naịra iri atọ nakwa onyinye ụgbọala Innoson nakwa onyine ndị ọzọ ruru nde 30 ma a gụkọta ya ọnụ. 7) Davido na ndị Igbo malitere ịgọ ọgọ: Otiegwu David Adeleke a ma dịka Davido gara kụọ aka n'ụzọ Chioma Rowland enyi ya nwaanyị n'ọnwa Septemba. N'ime otu ọnwa ahụ, ọ gbanyere ọlaaka igosi ya na ọ chọrọ ịlụ ya. N'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba, nwata nwoke ya na Chioma mụrụ bịara ụwa. Ha gụrụ ya David Adedeji Ifeanyi Adeleke. Ọ bụ n'afọ 2020 ka a ga-agba nkwụ nwaanyị? Ka anyị na-elenu. 8) Burna Boy ọ ga-enweta Grammy? N'ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba ka Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu metara ihe tinyere ndị Naịjirịa ọchị n'ọnụ ọzọ. Ụbọchị ahụ ka ozi pụtara gosiri na e debanyere aha ya na ndị nwereike inweta ntuurugo egwu na mba ofesi nke a kpọrọ Grammy. A họpụtara ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'agba ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album' na Bekee. Ka anyị na-ele ma nke a ọ ga-erute ụlọ. 9) Ntuliaka 2019: Ọ bụ naanị nwa e bu n'afọ nwereike ikwu na ọ maghị na e mere ntuliaka na Naịjirịa n'afọ 2019. Ntuliaka ahụ malitere dịka 'chi bọọ a nụ ọzọ', mana o mechara bụrụ ihe gara aga ugbua. E sitere n'iyigharị ụbọchị e kwesịrị ime ntuliaka, banye na Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị Ipob ịpụta sị ndị mmadụ ha pụta tụọ vootu karịa ịgbaghapụ ya dịka ọ gwaburu ha mbụ. A kpọpụtara aha Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye meriri, mana Atiku Abubakar bụ onye kacha gbalite elu ya na ya zọrọ ya ekwenyeghi na mpụtara ahụ. Ọ gbara Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị na-ahụ maka ntuliaka, mana ha mechara sị na ọ bụ Buhari meriri n'ezie. N'otu aka ahụ ka nke Imo steeti wuru maka ihe mere n'etiti Rochas Okorocha, Uche Nwosu bụ ọgọ ya nwoke nakwa Emeka Ihedioha. Ibeawuchi Ihedioha meriri na ntuliaka ahụ, Nwosu agbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe, mana ụlọikpe weliri Ihedioha aka dịka onye nwe oche ọchịchị ahụ. N'aka nke ọzọ, Okorocha zọrọ oche ya n'ụlọomeiwu ukwu elu zọọ ya ala tupu o mechaa nweta ya ka e duchara ndị omeiwu ibe ya iyi ọrụ. 10) Ọbịbịa Cardi B: Cardi B bụ otiegwu ezigbo aha ya bụ Belcalis Marlenis Almánzar, bịara Naịjịrịa naanị abalị atọ, mana o zuru ịtụgharị obi ọtụtụ ndị na-ahụbughi ya n'anya, mee ka ọ bụrụ 'ọdị n'obi' ha. N'ime ụbọchị ole ahụ ọ nọrọ Naịjirịa, ọ gara zụrụ ọtụtụ ihe ịga leta ndị enweghi etu ụwa dị ha adị, ọ gakwara n'ihu zaa aha Igbo (Chioma B). Ọ gwara ndị kpọtara ya sị ha kpọga ya ebe ọ ga-eri ezigbote nri Naịjirịa, na-abụghị nke ndị ụlọoriri na ndina. Maka etu o si nweta obi ndị Naịjirịa, ha na ndị Gana bụ ebe ọ gawara ka o si Naịjirịa pụọ, malitere ịkọ ọnụ maka mba kacha masị otiegwu a. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi" afirika-49030625,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49030625,"Ruga Settlements: Tupu mmadụ azụọ ala buru ibu n'Abia, anyị ga-amata ihe o ji ya eme - Kọmishọna",E jighị ihe a na-agba na ntị agba n'anya.,"Gọọmentị etiti tụpụtara atụmatụ Ruga iji kwụsị ọgbaaghara na-adịkarị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọha obodo Nke a bụ ihe gọọmentị Abia steeti na-ekwu banyere atụmatụ 'Ruga Settlement' nke gọọmentị etiti wepụtara na nsonso ma kwụsịkwa ya. Iwu ọhụrụ e tiri na steeti ahụ bụ na tupu onye ọbụla azụọ ala ruru hekta ise, ọ ga-akọwara gọọmentị ihe o ji ya eme. Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ John Okiyi kọwaara BBC ihe kpatara e ji tie iwu a. Kọmịshọna mgbasa ozi na Abịa steeti, John Okiyi, sị na ọdịghị mma ka gọọmentị were ala a ga-eji kọpụta nrị wee mee Ruga Okiyi kwuru na Abịa bụ steeti nke abụọ maọbụ nke atọ ala ha kacha dị nta na Naijiria. Ya mere, ""anyị enweghi ala anyị jị akọ nri, ma ya fọdụ nke e ji eme 'Ruga' maọbụ 'cattle colony'"". Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị Abia chọrọ ka ndị mmadụ bịa mepee ụlọọrụ dị icheiche na steeti ahụ mana Ruga esoghị ya. O kwuru sị: ""Onye chọrọ iji ego achụ ego, ya bịa n'Abia steeti, anyị ga-anabata ya. ""Anyị ga-enye ya afọ ise sị ya akwụla ụtụ isi, mana anyị achọghị ihe nwere ike iwetara ndị obodo anyị ọgbaaghara na ọnwụ."" Ihe di iche na Ruga na 'Cattle Market' Ọgbọ ehi buru ibu n'Abia Steeti Okiyi kọwara na ndịiche buru ibu dị n'etiti Ruga na ahịa ebe a na-ere ehi. N'okwu ya: ""Anyị amachighi mmadụ ire ehi. ""Onye chọrọ ire ehi ga-eji ụgbọala buru ehi ya bute n'ahia ebe a na-ere ehi. ""Anyị nwere ọgbọ ehi n'Aba, na Lopkanta, na Garki n'Umuahia na ebe ndị ọzọ. ""Onye buru ehi ya bịa, rechaa, ọ laghachikwa ebe o si bịa. ""Anyị achozighi ndị na-akpụ ehi akpagharị, emebiri anyị ihe anyị kụrụ n'ugbo."" Mana Ruga, dịka Okiyi si kọwaa, bụ ebe ndị ọchịehi ga-ebi ebi, ga-adị ka obodo nke aka ya, ebe gọọmentị steeti enwekwaghị ikike ọbụla. ""Mba! Anyị achọghị ụdị ahụ."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Mgbe ihe dị mma anyị na-enweta N2000' Morocco nwa Maduka:" afirika-43780044,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43780044,Na Senegal a na-enwe ọgbakọ banyere ịba,"Dịka onye ntaakụkọ BBC na Dakar bụ Alex Duval Smith si kọwa, , ndị nchọpụta na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọrịa ịba (malarịa) dị pụkụ atọ abatawala mba Senegal maka ọgbakọ ịkpa etu a ga-eji kpochapụ ịba.","Anwụnta na-ebute ọrịa ịba Nke a bụ afọ iri abụọ kemgbe ejirri nwe ọgbakọ ụzọ dị icheiche agaesi merie ịba nke a kpọrọ 'Multilateral Initiative on Malaria,' na bekee na-emekwara na mba Senegal. O ge ahụ, olileanya na a ga-ekpochapụ ịba nke a na-ebute site na anwụnta ka dị anya. Ma ugbua, ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ kwenyere na kpochapụ ịba na mba Afrịka isii; Algeria, Comoros, Madagascar, Gambia, Zimbabwe na Senegal. Senegal agbalịela n'ọgụ ha na-alụ site na i belata 40% ọnwụ site n'ọrịa ịba na 10 pasenti. Ọganihu e nwere na-egosi nsogbu ọhụrụ. Ịba na-agbaike na mba iri itoolu n'ụwa mana ọnwụ site n'ịba kachasxsị na naani ịrị na asatọ n'ime ha. ọnwụ site n'ọrịa ịba gbaliri elu na Najiria, Aịvrị Kostụ, Saụt Sudan na Centralụ Afrika Repọblik. Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44143555,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44143555,Ụlọikpe amachiela EFCC na DSS ịchọ ihe n'ụlọ Wike,"Ụlọikpe ukwu nọ n'Abụja amachiela ndi uweojii, ndị DSS na ndị EFCC ị gaa n'ụlọ aka na-achị Rivers steeti bụ Nysom Wike maka ịchọ ihe ọbụla.","Ọkaikpe Ahmed Mohammed bu onye nyere iwu a n'ụbọchị Wenesde mgbe okwuru na agaghị enye ha akwụkwọ ka ha ga chọọ ihe n'ụlọ ndị Wike nwere makana o nwere ikike machiri inyocha ya maka ọ bụ gọvanọ. Ihe bụ ihe iwu ala Naịjirịa kwuru. N'afọ 2017, Wike gara ụlọikpe ka o nwete ikike ga-amachi onyeisi ndị uweojii, ndị EFCC na ndị DSS i nweta akwụkwọ ga-enye ha ikike ị ga n'ụlọ ya ga mee nyocha. Mana ndị a akpọrọ aha kwuru na ha nwere ikike ị ga ụlọ Wike. Ka Ọkaikpe Mohammed na nye ikpe ya, ọ tụrụ aka na ndị a akpọrọ aha kwenyere na ihe Wike kwuru na ihe iwu ala kwuru bụ na agaghị eme ya nyocha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50386381,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50386381,Mbonu Ojike: Ihe ị kwesịrị ịma maka dimkpa Igbo a,Gịnị ka ị ma maka Maazị Mbonu Ojike?,"Kedụ nke a ga-akpọpụta nwoke a abụghị? Odeakwụkwọ? Ọgụegwu? Onye nkuzi? Onye ndọrọndọrọ ọchịchị? Kedụ nke a ga-akpọpụta aka ya adịghị n'ime ya? Ojike so na ndị Igbo nwere oke ọgụgụ isi mere ka a mara ya amara oge ọ dị ndụ. E mechara mara ya maka okwu ọ na-ekwukarị bụ ""Boycott all boycottables"" na Bekee, nke pụtara ""gọpụ onwe gị ma ọ bụrụ na ọ dabaraghị gị"". Lee anya ka BBC Igbo kọwaara gị maka ya. Ihe ị kwesịrị ịma maka Mbonu Ojike: Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12" afirika-47616016,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47616016,Building collapse in Lagos: Ụlọ ọzọ adaala merụọ mmadụ anọ ahụ n'Oke Arin,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Legọs Aịlandị.,"Ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Lagos Island. Akụkọ ahụ kwuru na ụlọ ahụ dị na 57, Egerton Square, Oke Arin, dara ebe elekere atọ nke ehihie a. Ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs nke a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ kwuru na ọ bụ ndị na-akpa 'alụmi' ka ụlọ ahụ dagidere. End of Twitter post, 1 Ha kwukwara na e bugala mmadụ anọ ahụ ụlọọgwụ ozugbo ozugbo. Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na e nyela ụlọ ahụ aka mbibi tupu ihe a e mee." afirika-43531058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43531058,Ndịagha asaala TY Danjuma maka ndị ọchiehi,"Onye bụbụ onyeisi ndịagha Naịjirịa, ma rụkwa ọrụ ka Minista na-ahụ maka nchekwa obodo nke bekee kpọrọ 'Minister of Defence' n'okpuru Olusegun Obasanjo bụ onyeisiagha TY Danjuma, kwuru okwu dara ụda ụnyaahụ ka ọ nọ n'emume iji sị ndị gụchara akwụkwọ daalụ nke e mere na mahadu, Taraba steeti dị n'isi obodo Taraba bụ Jalingo.","N'afọ 1976, T Y Danjuma bụ onyeisi ndịagha Naịjirịa Danjuma sị ka ndị Naịjirịa chekwaa onwe ha maka na ndịagha Naịjirịa na ndị omekome na-egbu mmadụ n'ebe dị icheiche na-arụkọ. Ka okwu a yabụ okenye kwuru ka na-erugharị, ndịagha Naịjirịa tinyere ọnụ na ya, wee sị: ""Anyi nụrụ ihe okenye a a na-asọpụrụ kwuru, mana anyị achọghị ịsa ya okwu. Mana, onwere ebe anyị chọrọ ido ndị be anyị anya. ""Ọ bụ ndịagha Naịjirịa ka e nyere ikike ịchekwa Naịjirịa ma nyekwa ndị nkịtị aka ma-agwa ha mee etu a. Maka nke a, ehibere atụmatụ nchekwa anyị kpọrọ 'Ọsọ buusu' n'usoro iwu na-achị Naịjirịa. ""Ya mere eji zipu ndịagha ka ha gaa gbochie ike ndị ọchiehi na-akpa n'etiti Naịjirịa, na ebe ndị ọzọ. Kemgbe ebidoro ""Ọsọ buusu"", gọọmentị Taraba akwadoghị atụmatụ a, maọbụ nyere ndịagha aka etu okwesịrị. ""N'agbanyeghị agwa a, ndịagha Naịjirịa akwụsịghị ọrụ nchekwa ha na Taraba, nke butere ogbugbu e gburu otu n'ime ha n'ụbọchị 16 nke ọnwa Maachị n'afọ a."" Mmachị ọchị ehi Ozi a ndịagha Naijiria zipuru gakwara n'ihu na-asị ka ndị Taraba nakwa ndị Naịjirịa niile na-aga n'ihu na-eme ihe ha na-eme ka o kwesịrị. BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ onye na-ekwuchitere gọvanọ Taraba Steetị nakwa onye na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu mana ha azaghị ekwenti ha. Anyị ga-ewetere unu ozi ma anyị nweta ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43252807,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43252807,Naijiria kachasị atụbata mmanụ n'ụwa niile,Naijiria bụ sọsọ mba nọ na otu mba na-egwupụta mmanụ n'ala nke a kpọrọ OPEC n'aha ịchafụ nke na-atụbata mmanụ ụgbọala ma bụrụkwa mba kachasị na ịtụbata mmanụ ụgbọala n'ụwa niile.,"Ụlọ osisi mmanụ nke Naijiria anaghị arụ ọrụ dịka okwesiri Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmanụ na Naijira bụ NNPC n'aha ịchafụ bụ Maikanti Baru kwuru nke a n'Abuja ụnyaahụ na ọgbakọ 'Oloibiri Lecture Series' nke afọ 2018. Baru, onye kwuru nke a site n'ọnụ Bello Rabiu bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ngwuputa mmanụ mgbe ọ na-aza ajụjụọnụ ndị bịara ebe ahụ jụrụ ya sị: "" Ka anyị- ekwu taa,Naijiria bụ sọsọ mba OPEC na-atụbata mmanụ ụgbọala. Anyị bụkwa mba kachasị na ịtụbata mmanụ ụgbọala n'ụwa niile."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ gara n'ihu sị: ""Anyị na-atụbata otu nde tọn kwa ọnwa n'ala na-egwupụta mmanụ na gaas ma nwekwa ụlọ na-esi mmanụ. ọ bụ ihe ihere. Onweghị uche dị na ya. ya mere anyị na-agba mbọ ileba ya anya."" 'Oloibiri Lecture Series' bụ otu ndị inginia a kpọrọ'Society of Petroleum Engineers (SPE),' nke Naijria na-ahazi ya iji cheta onunu mmanụ mbụ e gwuru na Naijiria." afirika-56461034,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56461034,Safety at Home: Saa anya mmiri ka ihe iri ndị a dị n'ụlọ ghara ibutere gị na ezinaụlọ gị nsogbu ahụike,"Ihe ụfọdụ dị n'ụlọ e ji egbo mkpa dị iche iche nwereike itinye mmadụ n'ihe mberede ga-ebute mmerụ ahụ maọbụ nsogbu ahụike nke Bekee kpọrọ ""domestic hazards"".","Dịka Dkta Okon Akiba kọwara ya, 'domestic hazards' bụ ""ihe ọbụla nwereike imerụ mmadụ ahụ n'ụlọ"". Lee ụfọdụ n'ime ha nakwa ihe ndị dọkịta ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa gburugburu na ụlọọrụ nke Bekee kpọrọ 'Occupational and Environmental Physicians', kọwara maka ha, nakwa etu i nwereike isi gbalahu ọghọm ha nwereike ibute: 1. Kamfọ Kamfọ bụ nzu Bekee ụfọdụ ndị mmadụ na-etinye n'igbe akwa ha maọbụ n'akụkụ ụlọ iji chụọ ụchịcha na ahụhụ ndị ọzọ ọsọ, nakwa ime ka akwa ha maọbụ ụlọ ha na-esi isi ọma. E ji ya arụ ọgwụ ụfọdụ, ọkachasị nke a na-ete n'obi maka oyi na ọtịta ahụhụ. Mana Dkta Abdulhakeem Abiola dọrọ aka na ntị kwuo na o nwere ike ibute ịba ọchananya. Ọdachi i kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ gị- Ọkachamara O nyere ndụmọdụ sị ""Ọ ka mma ka ndị mmadụ na-agba ọgwụ n'ụlọ ha na gburugburu (fumigation) mgbe ọbụla"". Ndị ọkachamara ahụike na websait WebMed kwuru na kamfọ nwere ike ibute ihe ọdịdọ, ọrịa imeju (liver disease) maọbụ ọnwụ ma mmadụ loo ya n'amaghị ama maọbụ o si n'akpụkpọ ahụ banye mmadụ ahụ. N'otu aka ahụ, Dkta Joseph Akinde bụ dịbia ahụike ụmụnwaanyị kọwara na kamfọ nwere ike ibute nsogbu na nwaanyị dị ime nakwa nke na-enye nwa ara. O nwere ike ime nwaanyị dị ime ọ mụọ nwa kga-eji nsogbu ahụike pụta ụwa. 2. Ọdọmmiri Ogwugwu Ụfọdụ ndị ọgaranya na-arụ ọdọmmiri ogwugwu nke Bekee kpọrọ 'swimming pool' n'ụlọ ha iji na-enyere ndụ aka. Mana a kpachaghị anya, ya bụ ihe e ji ekpori ndụ nwere ike ibute ọnwụ. Dịka Dkt Abiola siri kọwaa, ọdachi ahụike nwere ike isi na nke a pụta bụ mmiri iri mmadụ maọbụ mmadụ ibute ọrịa na-efe efe. N'afọ 2018, nwa nwoke Daniel Oyebanjo bụ otiegwu Naijiria a ma ama dịka D'Banj, nwụrụ dịka ọ dakpuru n'ọdọmmiri ogwugwu ha nwere n'ụlọ ha. Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara Dkta Okon Atiba nyere ndụmọdụ sị, ""Okenye amaghị egwu mmiri egwula mmiri naanị ya."" ""Ka onye nwere ọrịa na-efe efe, onye mmanya na-egbu, onye akwụkwụ maọbụ ihe ọdịdọ na-adọ (belusọ ọ gbakeela), ghara igwu mmiri."" Dkta Abiola sị na ọ dị mkpa onye na-azọ ndụ bụ 'Life guard' na Bekee ịnọ nso n'ọdọmmiri ogwugwu oge ọbụla onye amaghị egwu mmiri na-egwu mmiri. O kwukwara na ọ dị mkpa inwe 'life jacket' nso odommiri maka ndị amaghị egwu mmiri. 3. Ọgwụ Ọgwụ, ma nke mkpụrụ, ma nke mmiri nwere ike ibute ihe ndapụta ga-eduga mmadụ n'ụlọọgwụ maọbụ n'ala ili. Nke a ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ṅụfee ole dọkịta gwara ya ṅụọ, maọbụ mmadụ ṅụọ ọgwụ mebigoro emebi. Kpachapụ anya, ma debe ọgwụ ebe aka nwata agaghị eru ya. Tufuo ọgwụ ọbụla oge ya gafegoro ka mmadụ ghara ịṅụ ya na-amaghị ama. 4. Batịrị Ihe ọzọ a na-ahụ n'ụlọ nwere ike ibute ihe mberede bụ batịrị nke na-enye redio, ụgbọala, elekere na igwe ndị ọzọ ọkụ. Ọ dị mkpa na e wezugara ya n'ebe aka ụmụaka agaghị eru ya. Dịka Dkta Abiola si kọwaa, itinye batịrị n'ọnụ maọbụ ilo ya elo nwereike ibute ihe Bekee kpọrọ 'Lead poisoning' dịka 'lead' maọbụ alkaline e jiri mee ya ihiwe ehiwe hiba n'mgbụrụ afọ nke nwere ike imerụ nwata nnukwu ahụ n'ime, bute ụkọ ọbara maọbụ ọnwụ. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịgba mbọ hụ na i debeghị batịrị na nso ọkụ, mmiri maọbụ tụnye ya n'ọkụ ma ọ nwụọ. 5. 'Bleach' na mmanụ ọkụ (kerosene) na kemịkal ndị ọzọ Ụfọdụ kemịkal ị na-edowe n'ụlọ maka igbo mkpa ụfọdụ dịka nke eji asụ akwa Bekee a kpọrọ 'Bleach', nke a na-atụnye na mmiri maka igbu nje (disinfectant), nwere ike ịghọ 'oduchiegbu' ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ọ kachasị ma i nwee ụmụaka. Ụfọdụ okenye nwere ike amaghị ama buru mmiri kemical gbanye na nri maọbụ gbanye n'ọkụ nke nwere ike ibute ọdachị atụghị anya. Ụfọdụ agbaala ụlọ ọkụ maọbụ rie 'nsị' na-emerụ ahụ n'ihi ụdị ndajọ a. Otu ahụike mba ụwa WHO kwuru na ịna-ekuru kerosene oge ọbụla nwere ike ibute nsogbu mgbakasị arụ, ihe ọdịdọ, ajụ obubu, maọbụ ọnwụ. Dkta Abiola na-atụ alọ sị, ""Ekwela ka ọ dị ebe aka ụmụaka ga-eru ya."" ""Dee ha aha nke ọma ka mmadụ ghara iburu ha ṅụọ kpọọ ya ihe ọzọ."" Ndị dọkịta na-adụ ọdụ ka ị ghara ịgwakọ 'bleach' na 'ammonia'. Ha kwuru na ịgwakọ ha abụọ nwere ike iwepụta anwụrụ nke nwere ike imebi ihe n'ime ahụ gị ma i kuru ya. Kpachapụanya ebe ị na-atufu komkom kemical gwụrụ agwụ. 6. Ọkụ Ihe ndapụta ọkụ latrik nwere ike isite n'ụdọ ọkụ ekpuchighị ekpuchi ọfụma maọbụ nke oke tara. Ọkụ ọgbụgba nwere ike ibute anwụrụ ikogbu mmadụ. Ọkụ nwekwara ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ gbagbuo mmadụ maọbụ mee mmadụ iji ụjọ wutuo n'elu maọbụ gbaa ọzọ n'ụzọ nwere ike ibute nnukwu mmerụahụ maọbụ ọnwụ. Dkta Atiba kwuru sị, ""onye ọbụla kwesịrị inwee igwe mmenyụọkụ n'ụlọ, igwe mgbamaọkụ nkwa akwa mmenyụọkụ."" ""Gbanyụọ isi ebe ọkụ latrik ahụ si apụta ka 'oxygen' na-eme ka ọkụ ahụ na-enwu gbanyụọ."" ""Ejila mmiri emenyụọ ọkụ si na ọkụ latrik malite."" ""Ọkụ na-agba, were mmiri na-agbọ ụfọfụ menyụọ ya"" Abiola kwuru mkpa ọ dị ibeku ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ. ""Ezinaụlọ ọbụla kwesịrị inwe ekwentị ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ."" 7. Ala na-amị amị/'Bathtub' Ihe na-atọ ụtọ na-egbukwa egbu. Ọba asamahụ (bathtub) bụ ihe na-eneyere mmadụ aka ịsama ahụ n'ụzọ dị ụtọ mana o nwere ike ibutere mmadụ ọdachi ịgbajị ụkwụ, ukwu maọbụ kpụkpụ aka. Nwaanyị dị ime etiela afọ n'ala maka ịsa ahụ n'ime ọba asamahụ enweghị nchekwa ọbụla. Onye mmanya na-egbu maọbụ onye ahụ adịghị nwekwara ike ịda kụọ isi maọbụ akụkọ ndị ọzọ n'ala n'ihi ala ọmịmị. N'ihi ndị ndapụta dị otu a, Dkta Abiola, nyere ndụmọdụ sị, ""Gba mbọ tinye ute ụkwụ nwere eze n'ebe a na-asa ahụ."" ""Gba mbọ hụ na ịkwafughị mmiri n'ala . Ịkwafuo mmiri, i fichapụ ya ozigbo."" 8 . Ebu (mould) Dịka Dkta Abiola siri kọwaa, ebu dị na nri maọbụ na ebe ụfọdụ n'ụlọ nwere ike ibute nsi nri (food poisoning). Gbaa mbọ hụ na ebu anaghị eto n'ime ụlọ asamahụ gị. 9. Mma, ngaji na ngwa dị nkọ N'usekwu ka ihe mberede na-emekarị; ọ bụghị ọkụ, ọ bụrụ mmiri maọbụ ọ bụrụ ngwa ike e ji eme ihe dịka mma, ngajị na ihe ndị ọzọ e ji esi nri na ngwa ndị dị nkọ. Ihe ndị a nwere ike imerụ mmadụ ahụ maọbụ bute nsogbu ahụike. Dkta Akiba nyere ntuziaka ka ""i wezuga mma na ihe ndị ọzọ ga-emerụ mmadụ ahụ ebe aka ụmụaka agaghị eru ha"". 10.Igwe na-enye ọkụ Ọtụtụ ezinaụlọ ekpochapụla n'ihi ịdọba igwe na-enye ọkụ n'ebe ekwesịghị. N'afọ 2019, anwụrụ si n'igwe na-enye ọkụ kpochapụrụ ezinaụlọ mmadụ asaa; nne, nna na ụmụaka ise n'Ikwerre Rivas steeti. Dịka ndị ọkachamara si kọwaa, igwe na-enye ọkụ na-ewepụta anwụrụ nke nwere ikuku Bekee kpọrọ 'carbon monoxide'. Dọba igwe ọkụ gị ebe anwụrụ ya ga na-apụ apụ. Mmanụ 'petrol' a na-agbanye n'igwe ọkụ ekwesịghị ịdị n'ime ụlọ. Debe ya na mpụga ebe aka ụmụaka agaghị eru ya." afirika-47320447,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47320447,Anambra Mortuary Fire: Ọ bụghị eziokwu na o nweghị ihe gọọmenti mere- Gọọmenti Anambara,"Izu ole na ole gara aga, ọkụ gbara ụlọzụ dị n’ime ụlọọgwụ ‘Enugwu-Ukwu General Hospital’, Anambra steeti.","Nke a metụtara ozu ọtụtụ ndị mmadụ. Izu gara aga, ndị ezinaụlọ o metụtara mere ngagharịiwe na-ekwu na-ebunyebeghị ha ozu onye nke ha, ebe ụfọdụ na-ekwu na nkwa iti aka n'obi gọọmenti kwere ha na e mezubeghị ya. BBC gbara ụfọdụ n'ime ha ajụjụ ndị kọwara iwe ha. Anyị nụtakwara olu gọọmenti site n'ọnụ ndị isi ụlọọgwu nakwa ngalaba ahụike na steeti ahụ. Gee ya n'uju n'ihe nkiri a: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43936226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43936226,Ọtụtụ mmadụ apụtaghị nyocha maka ịkpọghachi Dino Melaye,Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa nke a na-akpọ Independent National Electoral Commision (INEC) n'aha ịchafụ eforola ntutu taa na ha ga-aganihu n'usoro nkpọghachi Dino Melaye agabanyeghi na onye omeiwu ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ.,"End of Twitter post, 1 Dịka INEC si kwuo n'oge mbụ, usoro nyocha ndị binyere aka n'akwụkwọ maka mkpọghachi ya bụ onye omeiwu bidoro taa. Nyocha ahụ bụ maka ndị Kogi sentraal bụ ebe Melaye na-anọchị. Ndị INEC gosiri nyocha ahụ ha na-eme n'akara twitter ha. End of Twitter post, 2 Ọtụtụ ndị deburu akwụkwọ degara INEC n'afọ 2017 ka akpọghachi Dino dịka onye nnọchi anya mana usoro ahụ kpụrụ ukwu n'ala maka akwụkwọ dị icheiche a gbara n'ụlọikpe nke ruru ụlọikpe ukwu. Mana ụlọikpe ukwuu enyebeghi ikpe ya gbasara okwu ahụ nke Melaye gbara akwụkwọ ka ha kwụsị INEC kpọghachi ya. Agbanyeghi na ndị ụlọikpe ukwuu ekpebibeghi ikpe ahụ, INEC gara n'ihu n'usoro nkpọghachi Melaye. Onye na-ahụ maka ikuzi maka ntuliaka n'ụlọọrụ Inec na Kogi steeti bụ Ahmed Bagudu Biambo gwara BBC Igbo na ya bụ usoro nyocha ahụ ebidola taa. O kọwara na nyocha ahụ gbasara binyerela aka ha n'akwụkwọ iji kpọghachite Melaye. N'okwu ya: ""Ndị ọrụ anyị nọ n'ebe a nha-eme ntuliaka 552 na Kogi sentraal nime 560 ebe a na-eme ntuliaka n'oge ahụ"" ""Ndị na-ebinyeghi aka enweghi ihe gbasara ha ịbịa ebe ahụ, naanị ndị binyere aka bụ ndị kwesiri ịbịa."" Biambo kọwara na ndị binyere aka ga-eweta kaadị ntuliaka aka iji gosi na ọ bụ ha binyere aka nakwa na ha tozuru etozu ibinye aka. Ụfọdụ ndị mmaọ̄ụ ekwuola na e nwere mmerụaka dị na ya bụ usoro mana Biambo kọwara na ndị na-anọchite anya ndị gbara akwụkwọ mkpọghachite na ndị agbara akwụkwọ nọ ebe niile a na-eme nyocha ahụ ihụ na a na-eme ihe ziri ezi. Cheta na Dino Melaye ka nọ n'ụlọọgwụ dịka o meruru ahụ oge ndị uweojii chọrọ ịkpọrọ ya gaa Lokoja ụbọchị Wednezde. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43870983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43870983,Akụkọ kachasị n'abali: Ezenwaanyị mba UK enwetala nwa ọhụrụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Dino Melaye na ndị uweojii Dino Melaye na ndị uweojii na-akwata kamgbe ụtụtụ taa. Dino Melaye nọ n'akara ya na Twitter depụta na ndị uweojii ruru mmadụ iri atọ bu egbe wuchiri na be ya na Maitama dị n'Abuja. Mana ha tọhapụrụ ya ebe ha jideburu ya n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja n'ụzọ ka ọ chọrọ ịga Moroko. Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị uweojii na-ahụ maka mba dị icheiche bụ ndị nwụchiri ya. Naịjirịa amaala ihe ha ga-eji ego Abacha mee. Gọọmentị Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ iji ego ruru nde dọla 332 Abacha zuru oge ọ nọ n'ọchịchị nke ndị gọọmenti Swiz weghachitere na Naịjirịa. Mịnịsịta okwu ego dị n'aka bụ kemi Adeosun kwuru na a ga-eji ego nye ndị ụbịam dịka onyeisiala Muhammadu Buhari kwere na nkwa oge ọ na-azọ ọchịchị. Egbuola nwafọ Naịjirịa ọzọ na mba Sawụtụ Afịrịka. A gbaala nwa Naịjirịa ọzọ ọkụ n'obodo Rustenburg dị na mba Sawụtụ Afịrịka dịka igwe mmadụ ahụ a gbasịrị ụgbọala ya ọkụ. Onyeisi otu ụmụ Naịjirịa bi na Sawụtụ Afịrịka bụ Adetola Olubanjo kwuru nke a. Nke a bụ nke mere ọhụrụ a na agha ndị mba ahụ na-ebuso ndị Naịjirịa bi n'obodo ha. Ndị uweojii na Sawụtụ Afịrịka ekwukwala na ihe ahụ mere bụ eziokwu ebe ha kwuru na e nwere ebe abụọ ndị a na-amaghị gbara ụgbọala ọkụ. Na mba ofesi ezinaụlọ ezenwaanyị mba UK enwetala nwa ọhụrụ. Nwunye onye nlekọta Cambrij bụ Catherine amụọla nwa ọzọ. Nwa nwoke ahụ a mụrụ na London taa bụ onye nke ise n'ụzọ ocheeze mba UK ma bụrụkwa nwa nke isii n'agbụụ nke agbụru anọ Ezenwaanyị Elizabeth. N'egwuregwu, Rangers na Ifeanyị Uba FC Ndị otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu na otu egwu bọọlụ Ifeanyi Ubah gbara onwe ha onye laba onye laba na Nnewi. Rangers nke Enugwu nọ n'ọkwa nke asaa ebe ha ji akra iri abụọ na anọ ebe ndị Ifeanyi Ubah nọ n'ogo nke iri na abụọ ebe ha ji akara iri abụọ na abụọ. Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48447716,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48447716,Gwongworo abụọ bu mmanụ ụgbọala enwurula ọkụ ma gbapịa ụgbọala n'ụzọ Legọs,Akụkọ na-ewu na mgbede a,"Ihe mberede okporoụzọ emerụọla mmadụ ise ahụ n'ụzọ si Ibadan gawa Legọs Ihe ruru mmadụ ise merụrụ ahu n'ụtụtụ taa ka gwongworo abụọ bu mmanụ ụgbọala kwakọrọ isi n'ụzọ si Legọs gawa Ibadan. Ndi hụrụ mgbe o mere si na ọkụ si ihe mberede a gbara ụfọdụ ụgbọala ndi ọzọ nọ n'okporo ahụ. Onyeisiala Buhari na ndi ọzọ anụọla iyi ọrụ Njem ọchịchị onye kwuo uche ya nke ọzọ malitere taata na Naịjirịa dịka onyeisiala Muhammadu Buhari, osote ya na aka na-achịgasị steeti dị iche iche ọnụrụ iyi ọrụ. Nke bụ agba nke atọ Buharị dịka onyeisiala Naịjirịa dịka ọchịbụrụ ka onye agha n'afọ 1984 tupu ọ rịa dịka onye nkiti n'afọ 2015. Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ ano sọkwa na ndị ṅụrụ iyi ọrụ taata. Steeti ndị a bụ Ebonyi, Enugwu, Imo na Abịa. Awụrụ Nusrat mmanụ ọkụ wee mụnye ha ọkụ Anwụchiela mmadụ 16 maka iji ọkụ gbagbuo nwa agbọghọ Na mba Bangladesh, a kpupula mmadụ iri na isii a na-eche n'aka ha di n'ihe mere nwa agbọghọ eji ọkụ kwagbuo ụlọikpe. Awụrụ Nusrat Jahan Rafi mmanụ ọkụ wee munye ya ọkụ ka ọ gbara ama na onye isis ọlụ akwụkwọ ha na awakpo ha n'ike. 'Ipob nyụọ anwu, ọ gbaa ha!' - Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu Ndi uwe oji n'Enugu steeti esitela n'ọnụ 'commissioner of police' bụ Suleiman Balarabe gwa ndị Enugu steeti na ha dị njikere maka iwu ndị Ipob mara gwa ndị mmadụ na ha aputa kwala ezi n'ụbọchi Mei 30. Ha kwuru nkea na ọgbakọ ha na ndị otu na ngalaba dị iche iche n'Enugu steeti nwere. Germany na France: Onye ga achị EU ? Germany na France na-ama aka ọnye ga-achị European Union dịka emechara ntuliaka ịhọpụta onyeisi otu ahụ n'ụbọchị May iri abụọ na asatọ. Nne ukwu ndị Germany bụ Angela Merkel chọrọ ka ọnye nke ya banye mana ọnyeisiala France bụ Emmanuel Macron akpọtaghị nwoke Germany aha dịka ọnye na-azọ oche onyeisi EU. 'Mmachi USA machiri anyị ga eri ọrụ igwe mmadụ n'Amerịka' - Huawei Na mba US, ụlọọrụ Huawei na-empụta ekwentị ekwuola na mmachi a machiri ha ga-emetụta ndị mba US n'ụzọ na-adịghị mma. N'Egwuregwu, Chelsea na Arsenal bụ otu egwuregwu na-ejighị anya ahu onwe ha ga-akwata ya n'agba ikpeazu asọmpị English Europa League taa n'ọgbọ egwuregwu Olympic dị na Baku, Azerbaijan. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50619964,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619964,World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha,I hụtụla onye kpuru isi na-eme achịcha bekee ọfụma? Nke a bụ ihe BBC Igbo hụrụ mgbe anyị gara zute Amarachi Onyedilefu.,"Nwagbọghọ a gwara anyị na o kpuru isi kamgbe ọ dị na nwata mana agbanyeghị ọdachị a, ọ gaala mahadum ma na-emepụta achịcha bekee. Gere ihe ndị ọzọ ọmalicha ada Igbo a na-eme ga-akpalite mmụọ gị. Ndị mere ihe nkiri a: Uche Akolisa na Vining Ogu Akụkọ ndị ga-masị gị" afirika-44978763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44978763,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Atletico etiela Arsenal mmonwu,Atletico Madrid akwatuola Unai Emery na International Champions,"Aka gbajiri onye na-achịkọta otu Arsenal bụ Unai Emery n'asọmpi ya nke mbụ o du ha ga. Atletico Madrid ji ọkpụ atọ a satara otu tie Arsenal mmonwu n'asọmpí International Champions na-eme ugbua. Willie Obiano ọ chụọla ndị ọrụ ya? Mmadụ isii sọ na ndị isi oche ọchịchị ime obodo n'Anambra bụ ndị akụkọ kwuru na a sị ka ha kwara ngwonwgo ha laba maka aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano sị na ya chọrọ ndị ọhụrụ. Mara na ndị nwere olileanya na ha ga-eso zọọ ndọrọndọrọ ọkwa ọzọ na ntuliaka a ga-eme na 2019, kwesiri iritu n'oche tupu ha bido njem ndọrọndọrọ. Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa taa Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa kpam kpam taa site n'elekere itoolu ruo iri na otu nke abalị taa. Ọkammụta Augustine Ubachukwu bụ onyeisi 'Astronomy and Astrophysics Research Group' na mahadum Nsukka na-ezipu ozi nkea. Nọt Koria ebunyela ndị Amerika ozu ndịagha ha Onyeisiala Nọt Koria bụ Kim Jon Un, nyere Amerika ozu ndị agha Amerịka nwụrụ na agha Koria nke mere n'etiti afọ 1950 na 1953. Onyeisiala Amerika bụ Donald Trump kelere Kim maka omume mana o kwuru na ndị agha ala ha karịrị puku isii ka na chọ n'ala Nọt Koria. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe onyonyo anyị Ndị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu" afirika-43746605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43746605,Abaribe kwuru na 'Buhari adịghị ike ọrụ',Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Okwu Sịnetọ Abaribe gwara Onyeisiala Buhari Ndị Ụlọomeiwu ukwu nwere ọgbaghara n'etiti ha taa mgbe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe nke Abia Steeti kwuru na onyeisiala Mohammadu Buhari adịghị ike ọrụ. Abaribe rụtụrụ aka n'okwu onyeisiala kwuru na Lọndọn na ọ bụ ndị si mba Libịa butere ogbugbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụugbo. Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa INEC ekwupụtala ngwa ha ji eme ntuliaka 2019 Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ụlọọrụ ahụ agaghị eji ngwa electronic eme ntuliaka afọ 2019, kama ha ga-eji technụzụ maka ịgụkọ na ngọsịpụta ntuliaka ahụ. Yakubu kwuru nke a na mmechi ọgbakọ emere maka iji technụzụ eme ntuliaka na Mba Afrịka niile. Ndị otu PDP na ndị patị ndị ọzọ nọ n' ụlọ nta omeiwu na-esi ọwụ ka emegharia usoro ntuliaka ọchịchị na Naịjirịa Akụkọ ndị ga-amasị gị: Okwu Emmanuel Macron gbasara mwakpo Sirịa Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na onwere ihe ngosi na gọọmenti mba Sirịa jiri ngwagha kemịkal wakpoo obodo Douma. Macron kwuru na ọ ga-ekpebi mgbe ọ ga-eji ngwaagha ụgbọelu wakpọ Sirịa na nzaghachị. Emmanuel Macron kwuru na iji ngwaagha kemịkal awakpo bụ ị gafe oke N'egwuregwu CSKA Moscow ga-ele Arsenal ọbịa n'ukwu abụọ nke asọmpi Uefa Europa n'abalịa. Cheta n'ụkwụ nke mbụ, Arsenal jiri ọkpụ anọ asatara otu merie ndị CSKA Moscow n'asọmpi ahụ. Ahmed Musa na Alex Iwuobi Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto. 'Ọrụ gị kwesiri ịbụ nke kachasị mma na foto'" afirika-48851781,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48851781,RUGA Settlememt: Libya: Gọọmentị etiti akwụsịtụla atụmatụ ya,Gọọmentị etiti esepụtụla aka na RUGA Settlement,"Akụkọ dị mkpa: Gọọmentị etiti ekwuola na ha esepụtụla aka n'atụmatụ ịzụ ehi a kpọrọ RUGA Settlement rue oge a na-amaghị mgbe ọ bụ. Naịjirịa ga-ebinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari ekwuola na ọ ga-ebinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka nke bụ 'Africa Free Trade Agreement' na Bekee, mgbe ha ga-agbakọ Afrịka Yuniọn na Niger. N'ozi si n'igwe twitter ya, Buhari sị na o kwetara nke a ka o soro ndị ma maka ya kpaa izu. Ihe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA) A ga-echeta na Naịjirịa ekweteghi ibinyeaka na nkwekọrịta azụmahịa n'Afrịka nke bụ 'Africa Free Trade Agreement' na Bekee maka na ọ na-atulee uru nkwekọrịta a barala akụnaụba Naịjirịa. Ndị isi Afrịka ga-ezukọ n'izu a n'obodo Niamey. Bongo Adi :Ihe 'Africa Free Trade Agreement' pụtara Ozi si n'akara Twitter onye enyemaka onyeisiala Buhari bụ Bashir Ahmad kwuru na e mere nke a site na mkparịta osote onyeisiala Yemi Osinbajo na ndị gọvanọ ndị ọzọ nwere ta. Mana nke a ebutela oke okwu n'etiti ụmụ Naịjirịa, ụfọdụ na asị na nkwụsịtụ a dị mma ebe ndị ọzọ sị na ka gọọmentị kagbuo ya kpamkpam. @realFFK sị ka a kagbuo karịa ịkwụsịtụ ya: @renoomokrị kere Buhari maka ige ndị mmadụ ntị: Atiku: Agwa Elisha Abbo dị obimwute, o nweghị ebe mgbado ụkwụ Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 bụ Atiku Abubakar adụọla Senetọ Elisha Abbo ọdụ ka ọ rịọ mgbaghara ma nyefee onwe ya ndị uweojii maka ị ma nwaanyị ụra. Atiku onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter ya ụbọchị Wenezde si na ihe onyonyo ahụ dị "" obi mwute, o nweghị ebe mgbado ụkwụ"" Ọ gara n'ihu kpọkuo otu PDP ka ha lebanye anya n'agwa Abbo kpasara nwaanyị. Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuuzde gosiri ebe Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra chara ọkụ n'ọdọahịa. a na-ere ihe egwuregwu ndị okenye. Ogbunigwe agbagbuola mmadu ruru 40 na Libya Mmadụ iri anọ anwụọla ebe mmadụ iri asatọ merụrụ ahụ n'obodo Tripoli Libya mgbe ogbunigwe dakwasịrị ụlọ ebe ndị mbịarambịara bi. Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị nwụrụ n'ihe a bụ ndị mbịara mbịara si mba Afrịka. ""Ndị Dọkịta Anambra nwee ndidi"" Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Gọọmentị Anambara steeti ekwetala na ụgwọ a na-akwụ ndị dọkịta ezighi ezi mana ha sị ha nwee ndidi Nke a sị n'ọnụ Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi na-abịa dịka ndị Dọkịta gbara abụbọ ọrụ n'Anambra kemgbe izuụka asaa gara aga. Wole Soyinka kwuru na RUGA bụ ihe nwereike ịmee ka Naịjirịa nwuru ọkụ ma akpachaghị anya. Soyinka kwuru nke a mgbe a jụrụ ya ajụjụ gbasara RUGA gọọmentị chọrọ ịwepụta. O kwuru na Ranching ka mma karịa RUGA ma kwuo na ekwesiri ime ya ebe ọ gaghị enye ndị mmadụ nsogbu. N'egwuregwu, Otu bọọlụ Amerịka agbapụla otu England n'agba ịkpeazụ nke asọmpi Iko mbaụwa ụmụnwaanyị Nke apụtara na ha na mba Sweden maọbụ Netherlands ga-azọ ọkwa onye atọ na ngwụcha asọmpị ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị:" afirika-45098815,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45098815,Ọchụchụ onyeisi DSS bụ ịji zọrọ ihu gọọmentị-ọkaiwu,Otụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo bụ ọkaiwu Chima Nnaji ekwuola na ọchụchụ a chụrụ onyeisi DSS bụ Lawal Musa Daura bụ ụzọ gọọmeti jiri chọọ ịzọ aha ha dịka ndị mmadụ katọrọ omume ndị ọrụ DSS mere n'ụlọomeiwu nke etiti n'ụtụtụ Tuusde.,"Osote onyeisiala Naịjirịa Akụkọ kwuru na onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala Naijiria ugbua bụ Yemi Osinbajo chụrụ onyeisi ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ DSS n'ịchafụ bụ Lawal Musa Daura n'ọrụ. Akwụkwọ ozi si n'aka onye ozi ya bụ Laọlụ Akande ekwughị ihe mere e jiri chụọ ya n'ọrụ mana o kwurụ na iwu a manyere sị ya kwụsị ọrụ bidoro ozigbo. End of Twitter post, 1 O nyekwara iwu ka onye kachasị n'ọkwa bụ Matthew Seifa were oche ya. Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na Ọkaiwu Chima Nnaji nwere, o kwuru na ọchụchụ a chụrụ Daura 'erijughị afọ' n'ihi na ọ bụ iji zọrọ aha ha. N'uche Nnaji, ihe Daura mere bụ ihe e zi gara ya gaa mee bụ ihe o mere. Ọkaiwu Chima Nnaji kwuru ihe mere e jiri chụọ onyeisi DSS Nnaji kwuru na ọ bụ n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe DSS mere, ka e jiri were ya chụọ aja iji meda ndị Naijiria obi. "" N'ihi na ọ bụ ya bụ onye e zinyere ga nwụta nkapị kama na nkapị bịara siwe nnukwu isi. "" O nweghị ka ndị ahụ ga-eji buru egbe bịa gbochie mmadụ ịbanye n'ụlọomeiwu na enweghị onye gbara ha ume."" Cheta na n'ụtụtụ taa bụ Tuusde, ndị ọrụ DSS bu egbe ma kpuchie ihu ha wakporo ụlọomeiwu ma gbochikwa ndị omeiwu na ndị ọrụ ndị ọzọ ịbanye n' ọgba ụlọomeiwu. Ka ọdị ugbu a, ọtụtụ ụmụ Naijiria etoola Osinbajo maka ụkwụ ọ zọpụrụ. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu Twitter: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43102332,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43102332,Edochie si na ọjị bụ ihe eji anabata ndi obịa,Ịgọ ọjị ma ọbụ ikpe ekpere ọjị bụ nnukwu emume ndị Igbo na-eme. Onye Igbo ọ bụla kwenyere na ọjị bụ ihe eji anabata ndị obịa na omenala Igbo.,"Pete Edochie kọwara na nkọwa ihe ọjị putara bụ: Ọ - Omenala, J - Jikọrọ, I - Igbo. Nke a mere BBC Igbo jiri ga n'ulo ya bụ nnukwu onye echichi ka ọ goro anyị oji iji were mepee ngalaba ntaakụkọ ọhụ bụ BBC Igbo service. Nkata anyi na Pete Edochie ga na abịara unu na nkeji na nkeji. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47106799,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47106799,#BBCGovDebate: Nrụrịtaụka BBC Igbo niile abịala na njedebe,Ihe ndị dị mkpa mere taa,"Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ nke BBC Igbo hibere emechiela taa dịka emere nke Ebonyi steeti n'ehihie ụbọchị Sunde. Cheta na nrụrịtaụka a malitere na Imo steeti metụtakwara Abịa steeti dịka Igwe mmadụ pụtara ịjụ ndị ọchịchị ajụjụ dị ha mkpa. Ọzọ, End of Twitter post, 1 Onyeisi ụlọụka Redeemed na Naịjirịa bụ Pastor EA Adeboye emerela osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ụka mmamma n'ụbọchị sunda Nke a bụ maka ụgbọelụ helịkọpta bu ya dara n'obodo Kabba na Kogi steeti n'ehihe satọde. Na mba ofesi, Ụfọdụ ụmụnwanne ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ dị n'obodo New York emeela ngagharịwe maka ọnọdụ esi debe ụmụnwanne ha na mba Amerịka Iwe ha bụ na oyi na-atụgbu ụmụnwanne ha dịka ha enweghi ọkụ latrik maọbụ mkpoọkụ n'oge oke oyi a na mba ahụ. N'egwuregwu, Mmeri otu Manchester United meriri otu Leicester city na mgbede sunde ga-eme ya mmerị itoolu n'ime asọmpị iri otu Man U riterela n'okpuru onye ndu ọhụrụ ha bụ Ole Gunner Solskjaer. Ọ bụ Marcus Rashford nyere ọkpụ goolu ha jiri dọka neetị ndị Leicester Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ Ndọrịtaụka nke BBC haziri maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ jisike aga n'ihu ugbua. Taa ọ ga-akpọtụ n'Ebonyi steeti ebe ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ ga-enwe ndọrịtaụka gbasara etu ọchịchị ha ga-esi bara ndị steeti ahụ uru. Gọvanọ na-achị Ebonyi steeti ugbua bụ Dave Umahi ma bụrụkwa onye otU PDP so na ndị ga-eme ndọrịtaụka a. Ndị ọzọ ga-eso gụnyere Nnaji Igbokwe onye otu pati Accord nakwa Ogbonnaya Okorie bụ onye otu Advanced Allied Party. BBC Igbo ga-ewetere unu ka o sị aga mgbe a ga-amalite ya bụ ndọrịtaụka taa. N'akụkọ ọzọ, Inec etiela aka n'obi INEC kwuru na ha adịla njilkere maka ntuliaka na-abịanụ Dịka ntuliaka nke afọ a na-akpụkete nso, ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka akpọrọ INEC n'ichafụ ekwuola na ha adịla njikere ịme atụmaatụ a. Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na Inec bụ Festus Okoye kwuru na ha ebugala ngwa ọrụ a ga-eji mee ya bụ ntuliaka n'ụlọakụ ukwu bụ Central Bank of Naịjirịa ebe a ga-esi bụga ya ebe ndị a ga-eme ntulaiaka n'abali ga-efopụta ụbọchị ntuliaka. N'ofesi, Onye otu Africa Union akporọ Smail Chergui so wee hibee mkakorịtaụka a Enwela nkwekọrịta udo n'etiti otu nnupuisi ruru iri na anọ na gọọmenti etiti Central African Repọblịk ka enwechara mkparịtaụka na mba Sudan. Ọ bụ ndị ozi United Nations nọ na CAR akpọrọ Minusca nakwa Africa union bụ ndị kwadoro ya bụ mkparịtaụka kwuputere nke a. N'egwuregwu, Chelsea ji ọkpụ goolụ ise asataghị otu merie Huddersfield, TottenHam tikwara Newscastle otu ọkpụ goolu asataghị otu, Cystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Fulham ebe Wolves tiri Everton mmanwụ site n'inye ha ọkpụ goolu atọ asatara otu n'asọmpị Premiere League ụbọchị Satọde gara aga. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ndị Awụsa bi Ebonye pụtara ịkwado Atiku" afirika-54334142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54334142,Ọgbambọ: 'O nweghi onye sị na ihe nwoke ga-eme nwaanyị agaghị emenwu ya' - Nwaagbaghọ na-ama 'tile',Cynthia Ejike bụ nwata nwaanyị na-arụ ọrụ bu nke ụmụnwoke na-arụkarị.,"Ọ gụrụ ""Chemical Engineering"" na mahadum IMT dị n'Enugwu mana ọ sị na ya kpebiri ịrụ ọrụ dịka onye na-ama ""tile"" n'ụlọ. N'ihe onyonyo a, o kwuru etu mmasi ọrụ a jiri mee ka ọ na-edi ntarama ahụhụ dị n'ọrụ a ọ na-arụ. Ọ bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ" afirika-54109803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54109803,Gịnị na-esere ndị Ipob na ndị Afara-Ukwu? Lee ihe anyị ma,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna ekwuola na ndị uweojii amaghị maka akukọ na-efegharị na soshal midia banyere obodo Afara-Ukwu na ọgbaghara metụtara ezinaụlọ Nnamdị Kanụ.,"BBC kpọrọ Maazị Ogbonna ịmata etu obodo ahụ si kwụrụ dịka ihe onyonyo pụtara na Facebook ụbọchị Satọde nakwa Sọnde rụtụrụ aka na nsogbu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị dara n'etiti Emmanuel Kanu bụ nwanne onyeisi otu a kpọrọ Indegineous People of Biafra (Ipob) na ụfọdụ ndị obodo ha bụ Afara-Ukwu. N'agbanyeghị ihe ndị uweojii kwuru, Eze Okwulehie bụ onye eji Eze Afara mara, gwara BBC na ọgbaghara dara n'obodo Esiama Afara Ukwu ụbọchị Satọde nakwa Sọnde dịka Emmanuel Kanu batara obodo ahụ malite iyi ndị mmadụ egwu. Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia na-arụtụ aka na ụfọdụ ọgbaghara a mere, mana ha egosighị ebe Kanu mere ihe ọbụla maọbụ wakpoo onye ọbụla. Ihe onyonyo ""Facebook Live"" Eze Okwulehie tinyere n'akara ya na Facebook dị ka o gosiri ebe ụfọdụ ndị Afaraukwu na-eme ngaghari iwe maka okwu ha na ndị ha kpọrọ aha dị ka ""Ipob""." afirika-43638056,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43638056,Okwu mwakpo ndị ọchịehi a ga-ebi ebi?,"Mwakpo na na-ebo ndị ọchị-ehi na obodo Ọkpankụ nke dị n'Aniri, Enugwu Steeti na mkpu ndị Ụmụọwa Ibu nị n'Imo Steeti na eti maka etu ndị ọchi-ehi jị awakpo ma tọọrọ ụmụaka ha bụpụtekwara okwu banyere mpamkpa a na-ebo ndị ọchị-ehi na ebe dị icheiche na Naịjirịa ọzọ.","Ọtụtụ ehi na-agagharị n'ime obodo Enugu N'Ọkpankụ, akụkọ na-akọwa na ndịuweoji na-akasị ụmụokorobia ndị obodo ahụ obi na rịo ha nwe ndịdị gbasara okwu mere na be ha ebe ndị ọchịehi gara n'ime ebe obibi otu onye okaiwu. A sị na ha malitere ị ghọrọ mango n'ebe ahụ ma bekasia onye nche nọ ebe ahụ ahụ mgbe ọ bidoro ị bara ha mba maka mangoha na aghọrọ. Ebe ndị ụmụowa ibu n'Imo steeti na-ata ahụhụ maka na ha enweghị ike ị ga ọrụ ugbo chọta ihe oriri ha ga-eji chekwa onwe ha makak egwu ndị ahụ. Nsogbu ọzọ na-enye ndị umuowa ibu bụ ntọrọ a na-atọ ụmụaka ha chere naọbụ ndị ọchịehi ahụ na-eme. Okwu a ebeghị sọsọ na mpaghara ọwụwa anywanwu ka ọ na akpọtu ebe ndị steetị dị icheiche na-enwe kwa otu nsogbu a. Ọ metụtara obodo dị icheiche dịka Benue, Zamfara, Kogi, Ekiti, Edo na Plateau n'ọnwa ole n'ole gara aga. Eserese a na-egosi obodo ebe nsogbu a pụtara ihe: Mmachị ọchị ehi Gọọmentị Naịjiria kwuru na ha na-agbanị ị hụ na nsogbu a ga-ebi n'oge adịghị anya. Ha na ndịagha Naijiria gbakọrọ aka ị bido atụmatụ a kpọrọ 'ọsọ nwa mba' n'obodo Taraba, Benue n'Adamawa. Unyaahụ kwa ka ha dụpụrụ ndị agha pụrụiche sị ha ga ba obodo Zamfara nchekwa ma mmadụ ma udo na gburu gburu obodo ahụ. Akụkọ ga-amasị gị" media-52494528,https://www.bbc.com/igbo/media-52494528,Coronavirus Tips: Ahụ onye nwụrụ anwụ o nwere ike ibufe mmadụ coronavirus?,Ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 40 na Naịjirịa.,"Nke mere ka ngalaba 'National Centre for Disease Control' wepụta ndụmọdụ etu e kwesịrị isi lie onye ya bụ ọrịa gburu. Ọ bụ eziokwu n'ozu onye nwụrụ anwụ anaghị ekesa ya bụ ọrịa nke ukwu, mana ọ kwesịrị ka ndị mmadụ kpachapụ anya." 42696306,https://www.bbc.com/igbo/42696306,Ivana Trump: Donald abụghị onye na-akpa oke agbụrụ,"Nwunye nke mbụ Donald Trump siri na ọ bụ eziokwu na onye isị ala Amerika nwere ike me nkwuegheri oge ụfọdụ mana ọ bụghị onye n'akpa oke agbụrụ. Onye isi mba Amerịka bụ Donald Trump gbara isi onwe ya taa, sị na ọ bụghị onye na-akpa oke agbụrụ.","Ivana kwuchitere Donald Trump ọnụ N'izu gara-aga, Akụkọ kwuru na Trump kpọrọ ụfọdụ mba dịka Haiti, El Salvador na mpaghara Afríka 'ndị ajụrụ ajụ' ka ya na ụfọdụ ndị omeiwu ukwu nọ n'ọgbakọ na-akọ maka ndị mbịarambịara. Igbara isi onwe ya, Trump gwara ndị nta-akụkọ ""Abụghị m onye na-akpa oke agbụrụ. Abụ m onye ikpeazụ ị ga-agba ajụjụ onụ bụ onye ịkpa oke agbụrụ.""Donald Trump achịala mba Amerịka otu afọ Nke a bụ nke mbụ Trump na-asa ebubo ajụrụ ya gbasara ịkpa oke agbụrụ. Ọ gọnarịrị ebubo a ka ndị nta-akụkọ White House bịakutere ya na Trump International Golf Club dị na West Palm Beach, n'abalị Sunde gara aga." 52217326,https://www.bbc.com/igbo/52217326,Coronavirus Lockdown: 'Ụmụnwaanyị atagbuola onwe ha n'ahụhụ n'ihi mkpọchị obodo',"Kamgbe gọọmentị machiri mkpagharị ndị mmadụ n'ihi ọrịa coronavirus, ọtụtụ na-ebe akwa arịrị na ahụhụ akarịala.","Ọtụtụ ndị ka na-agakwa ahịa ire ihe n'ihi na ha kwuru na agụụ ga-egbu ha ma ha nọrọ n'ụlọ. Mgbe BBC gara n'ahịa dị icheiche ịmata etu ihe si aga, otu nwaanyị gburu ikpere n'ala rịọ onyeisiala Buhari ka ọ hapụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị na-ere ihe nri ka ha rewe ahịa ha. Nwaanyị a kwuru na ọ bụ ụmụnwaanyị kacha ata ahụhụ n'ihi mkpọchi obodo. Gere ihe ha kwuru." afirika-52237203,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52237203,Coronavirus Tips: Ọbụghị eziokwu na ndị ntorobịa enweghị ike ibute ọrịa coronavirus,"Ọtụtụ na ekwu na coronavirus bụ ọrịa ndị okenye, nke na ndị ntorobịa ọbara ha dị ọkụ agaghị ebute ya.","Onye gwara gị? Coronavirus egbuola ma ndị okenye, ma ndị ntorobịa, ma nwata a mụrụ ọhụrụ. Ya mere ụzọ kacha mma bụ ichekwa onwe gi. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimezie Ucheagbo na Chiemela Mgbeahuru Peter" afirika-56439470,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56439470,Anyị na-esi Ebonyi ala obodo anyị n'Enugwu maka enweghi ụzọ - Ndị Agunduma Nkanu,"Ndị obodo Agunduma dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East nke Enugwu steeti na-eti mpu etu ọnọdụ enweghi ọkụ, mmiri na ụzọ mere ka ha biri ka ndị mgbe ochie.","BBC Igbo gara obodo a were hu na ọ bụ akwa mmiri eji osisi ruọ ka ha ji apụ ma na-abata. Ide mmiri na-eburu akwa mmiri kwamgbe kwamgbe, nke na-eme ka ndị obodo ahụ tọọ na be ha, dịka enweghizi ụzọ e si apụ. Ndị obodo a gwara BBC Igbo etu o siri dịrị ha nakwa etu ọnọdụ a ji na-emetụta ahụike na akunaụba ha. Ha kwukwara etu gọọmentị Jiri gbaa ha nkịtị, n'agbanyeghị na ha akpọọla ha okwu. Kirie akụkọ a n'uju:" afirika-51945740,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51945740,Fertility Checks : Ajụjụ dị oke mkpa i kwesiri ịjụ onye nke gị tupu ụnụ alụọ,Alụmdi na nwunye abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba.,"O kwesịrị na ndị ọ dị n'obi ịlụ ga-ajụ ajụjụ dị mkpa banyere ahụike ha, ọkachasị ọnọdụ ịmụta nwa tupu ha alụwa. Lee ụfọdụ ese dị mkpa na nwoke na nwaanyị ga-ajụ banyere onwe ha tupu ha biri ka nwaanyị na di: 1. Ị riaala ọrịa nsina mmekọ mbụ? Nwaanyị a dịka ọ na- atụ arịrị sị,""Ọ kọwatasịghị m n ọfụma"" Ọrịa nsina mmekọ nke Bekee kpọrọ ""Sexually transmitted Infections"" bụ ọrịa na-emebi akpa amụ maọbụ akpa akwa (gonads) ma ọ bụrụ na a gwọọghị ya n'oge. Dọkịta Ayodeji Oluwole nke Lagọs University Teaching Hospital kwuru na ""ọ bụrụ na agwọghị ọrịa 'Gonorrhea', 'Syphilis,' 'Chlamydia', 'Hepatitis B' n'oge maọbụ na-agwọghị ya ọfụma, ha nwere ike imebi akụkụ ahụ metụtara ọmụmụ nwa."" Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara Nghọta ụfọdụ bụ na ọ bụ naanị nwaanyị na-agba 'alabanko' na-emebi ihe e ji amụ nwa n'ihi ọrịa so inwe mmekọrịta, mana ka ọ dị be oke ka ọ dị be ọgịnị. Idina onye ọbụla na-enweghị mgbochi nwere ike imetụ nwoke n'ihi na ọrịa nsina mmekọ taa akụ n'ime ahụ nwoke, o nwere ike ime ịmetụ mmiri amụ maọbụ mee ka mkpụrụ nwa ghara ịdị n'ime ya (azospermia). Cheta na ihe mere ụfọdụ ime ji apụ nwaanyị bụ n'ihi na mkpụrụ nwa si na-ahụ nke nwoke ejighị ahụ. 2. Gịnị bụ 'blood group' gị? E nwere otu ọbara atọ, Otu 'A', otu 'B' na otu 'O'. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị nwere Rhesus- negative (Rh−) lụọ nwoke nwere 'Rhesus- positive' ( Rh+ ) dị ime mbụ ya ọ bụrụ 'Rhesus- positive' ( Rh+ ), o nwere ike isi n'alọ (placenta) banye n'ọbara nwa ọzọ butere ya ọrịa a kpọrọ ""rhesus Disease. Ọ dị mma di na nwunye inwe otu ọbaego n'ụlọakụ? Dkta Joseph Akinde , onye nwe ụlọọgwụ Livingspring Hospital, Ejigbo, Legọs kọwara na ""nke nwere ike ime ka ime pụọ nwaanyị, maọbụ a mụọ nwa ahụ ọ nwụọ, maọbụ o nwee ọrịa obi, maọbụ nke ụbụrụ, maọbụ nwa ahụ enwe ọrụsị."" Ọ bụghị na nwaanyị nwere 'Rhesus- negative' agaghị alụ di, kama ọ dị mkpa ịmata nke a n'oge iji gbochie ọdachi amaghị ama. A na-agba nwaanyị nwere ya ọgwụ awa 72 o ji mụcha nwa iji mebie nke Bekee kpọrọ ""Rhesus-positive cells"" si n'ahụ nwa ọhụrụ banye ya n'ahụ. Nwaanyị mụọọla nwa mbụ maọbụ nke terela ime mbụ nwere ike inwe nsogbu a. 3. Nke nwaanyịọ tụọla ime mbụ? o teela ime mbụ? Nke a dị nnukwu mkpa n'ihi na dịka dọkịta akụ ike ụmụnwaanyị bụ Ngọzị Obi siri kọwa ọ bụrụ na ọ tụọla ime mbụ ya bụ na o nwere ike ịtụ ọzọ. Obi kwukwara na ọ bụụ na oteela ime mbụ, o nwere ike ibute nsogbu ga-eme ịtụ ime ọzọ ahịa ahụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na-ite ime nwere ike ime ka ọcha dị nwaanyị n'akpa nwa nke nwere ike ibute ọgbachị na-'fallopian tube' nke nwere ike ime ka ọ ghara ịtụnwụ ime. Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye Oke ite ime nwekwara ike ibute akpanwa enwenwughị ike ijidenwu nwa nke Bekee na-akpọ ""cervical incompetence.' ""Cervical incompetence' dịka ka ndị ọkammụta siri kọwa, na-eme na ime na-apụ ụfọdụ nwaanyị. 5. O nwere ọrịa ala ala? Ọrịa ala ala dịka varicocele , prostatis-ọrịa na-emetụta agede (prostate)- na ọrịa shuga nwere ike ime ka o sie ike nwoke ịtụwali nwaanyị ya ime. N'ụmụnwaanyị, ọrịa ala ala dịka ""endometriosis"" nwere ike ibute amụtaghị nwa, ebe ọrịa shuga nwere ike inye nwaanyị nsogbu n'afọ ime.' . Kedụ ụdị 'family planning' imerela mbụ? Kedụ nke ụnụ ga-agbaso ma ụnụ lụọ? O nweela atụmatụ igbochị ịmụ nwa imerela na mbụ? Ajụjụ a dị mkpa n'ihi na atụmatụ ọbụla nwere ihe so ya nke nwere ike imetụta ịmụ nwa. Ụmụ ole ka ụnụ ga-amụ? Nwoke ole, nwaanyị ole? so na-ajụjụ dị mkpa ụnụ kwesịrị ịjụ ma saa onwe ụnụ. Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile 6. Kedụ oge ibidoro hụwa nsọ gị? Oge nwaanyị bidoro hụwa nsọ ya maọbụ ụgboro ole ọ na-ahụ ya n'afọ( , ọ dị 'regular' ka ọ dị 'iregular', nwere ike ịrụtụ aka otu ọnọdụ ọmụmụ nwaanyị. Dr Joseph Akinde kọwara na ime nwere ike siere nwaanyị na-ahụ nso ya naanị ugboro abụọ maọbụ atọ n'afọ ike. 7. Kedụ mgbe o ji enwe 'ovulation' ya Nwoke ị ma ma onye nke ya ọ na-ama oge ọ nọ n'izi (ovulation) n'ihi na ọ bụrụ na ọ naghị anọ n'izi, ị mara na ọ ga-enwe nsogbụ ịmụ nwa . Dọkịta Obi sị,""Ihe ọ pụtara na ya bụ nwaanyị anaghị eyi akwa. Mkpa ọzọ ọ dị dịka ndị ọkachamara siri kọwaa bụ na ọ ga-enyere ha abụọ aka ịmata oge ha ga-anọkọ ime achapuo nakwa oge ha kwesịị ị nọrọ onwe ha maọ bụrụ na ha achọghị nwa. 8. Gịnị bụ 'Genotype' gị? Ọ bụ 'A' , 'AS' ka ọ bụ 'SS'? Onye nwere ọbara otu 'A' nwere ike ịlụ onye masirị ya, asịrị agaghị ịba ya. Mana onye nwere AS lụọ onye nwere AS ha nwere ohere pasent 25 ịmụta nwa nwere ọrịa 'sickle cell.' Dọkịta Akinde kwuru na ị mata nke ị bụ ga-enyere gị aka ịgbalahụ ị mụ nwa nwere sickle cell anamia. Igbochi afọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ Ọ gara n'ihu kwuo,""ilekọta nwa nwere sicjkle cell adịghịghị mfe. Ọ na-erikwa ego."" 8. I nwere HIV? O kwesịrị ka ndị chọro ịlụ onwe ha mee nnyocha ọbara iji mata ma ha enwere nje ọrịa HIV. Cheta na HIV bụ ọrịa a na-eke site na mmekọ, iji ihe dị nkọ onye bu ya bụ nje jiri mee ihe. Nnyocha ndị ọzọ dị mkpa gụnyere innyocha ahụike mkpụrụ nwa(sperm) nke Bekee kpọrọ 'seminal analysis'. Nneka na Isaac Moses maka Goge Africa 9. Nke nwoke enwere ọrịa mump oge ọ dị na nwata? Nchọpụta sayensi na-egosi na ụmụnwoke nwere mụmp oge ha dị na nwata na-enwe nsogbu ịtụwali nwaanyị ime ma ha tozuo dimkpa. 'Mump' bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-emepụta asọmmiri nke na-ebute akwakanti(nti ịza aza) nke a na-ekute n'asọmmiri onye bu ya.. Ụlọọgwụ Mayo Clinic rụtụrụ aka na 'mump' nwere ike ibute ntị ochichi, ọrịa obi, ime ipụ maọbụ bute mee mkpụụ amụ nwoke ịzawa aza ma otoruo okoro bịa Okwu dị mkpa Ọ dị mkpa ịmata na mmadụ nwere ike izu oke, na enweghị ọrịa ọbụla maọbụ nkwarụ ọbụla mana ha lụọ onwe ha, ime e sierie ha ike. Nke a ka Bekee na-akpọ 'unexplained infertility' nke bụ ime isi ike amaghị ihe butere ya.' Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50810147,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50810147,Biafra: Etu ndị Igbo ga-esi nwete ya - Tony One Week,Na mkparịta ụka ya na BBC nwere onye oti egwu eji Tony One Week mara kwuru maka atụmatụ Biafra.,"Ọ sị na Ojukwu anwaala ike ya tupu ọ laa mmụọ, mana ugbua ọ bụ atụmatụ ọhụru ka a ga-eji sowe okwu Biafra. Tony One Week Muonagor makwara atụ etu enwereike isi nweta ya bụ Biafra. Gee ya ntị. Ndị mere ihe nkiri bụ Nnamdi Agbanelo na Chioma Obianinwa Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51765578,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765578,Coronavirus: Lee akụkọ asi niile na-ewu n'Afrịka maka ọrịa a,"Dịka ndị bu ọrịa Coronavirus n'Afrịka ebubeghị ibu, kama ọtụtụ gọọmentị n'Afrịka ka na-agba mgba imegide akụkọ asị gbasara ya bụ ọrịa. Anyị ga-egosipụta ụfọdụ akụkọ asi ndị a na etu ha si bụrụ eziokwu ma ọ bụ asị .","1) Asi! Ọ bụghị iwu na ị ga-akpụcha afụ ọnụ gị maka nchekwa onwe gị maka corona virus. Ọ bụ ihe onyịnyo ochie ndị ngalaba na-ahu maka nchekwa nke Amerịka wepụtara maka afụ ọnụ na ihe nchekwa e ji ekpuchi imi. Ọ bụ ndị akwụkwọ ozi nke ""Punch"" nke Naijirịa buru ya bụ akụkọ. 2) Onye ndụ ndị ofufe Kraist Akụkọ na David Kingleo Elijah onye ndụ na "" Mount of Possibility church"" kwuru na ya ga-aga mba Chaina ibuso coronavirus ọgụ wuru na intanetị. N'oge na adịghị anya, akụkọ asị bidoro na-efegharị na ya bu ụkọchukwu gara Chaịna ma bute ya bụ ọrịa. Ha gosikwara ihe onyonyo ebe ha sị na ọ nọ n'ụlọọgwu maka na obutele ya bụ ọrịa. 3) Akụkọ asị maka onye na-akwọ ụgbọala Akụko asị na-enwere otu nwoke na-anya ụgbọala butere ya bụ ọrịa dịka o buru nwoke onyeọcha bụ ọrịa corona virus. Akụko asị a kwuru na nwoke a si n'ụlọọgwụ gbapụ ma kwuo ka enye ya otu nde narị naịra ma ọbụghị ya ọ ga-ebusa ya bụ ọrịa. 4) Ndị mba Kenya Ndị mba Kenya etiela mkpu na akụkọ na-agagharị na Shosal midia ebe gọọmentị kwuru na enwere mmadụ iri isii na atọ bụ ya bụ ọrịa coronavirus na Kenya. 5) Ọgwụgwụ ya bụ ọrịa Akụko ihe onyonyo ebe onye ụkọchụkwụ kwuru na ""pepper soup"" na-akwọ ya bụ ọrịa coronavirus. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45205565,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45205565,INEC: Anyị chọrọ ego dị ijeri naịra 189 maka ntuliaka 2019,Ndị ụlọomeiwu na ndị isi ụlọọrụ INEC nwere nzukọ ụnyaahụ n'ịza oku onyeisiala Buhari kpọrọ ha n'itinye aka n'akwụkwọ bọjetị ndị INEC maka ntuliaka afọ 2019.,"Ndị kọmitii ụlọomeiwu na-ahụ maka ụlọọrụ INEC gbarụrụ ihu ma jụọ ajụjụ maka ndiiche dị n'akwụkwọ Buhari zitere ha na nke ndị INEC zitere. Onyeisiala Muhammadu Buhari zigara ndịomeiwu bọjetị dị ijeri naịra 143 ka ha tinye aka na ya ozugbo, ebe ego dị ijeri naịra 43 bụ mgbakwụnye maka ọdịnihu. Mana onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu, gwara ndị ụlọomeiwu na ọ chọrọ ego dị ijeri naịra 189.207 bụ kpamkpam ego niile ha chọrọ maka ntuliaka afọ 2019. INEC na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka ntuliaka nke 2019 ga n'ụzọ ziri ezi Ihe a bụ Ụfọdụ ego ole INEC chọrọ na ihe ndị eji ha eme: Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha ma dịrị njikere maka ntuliaka Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46568346,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46568346,Gịnị bụ 'Manage' n'asụsụ Igbọ?,'Manage' bụ okwu bekee na abanyekarị ọtụtụ mmadụ n'ọnụ.,Mana ị mara ihe ọ pụtara n'ezie? BBC nwalere ka ụfọdụ ndị Igbo siri matabe asụsụ Igbo site na ị jụ ha ihe 'Manage' pụtara n'Igbo. Lee ọsịsa ha n'ihe nkiri a: Akụkọ ga-amasị gị: afirika-55790862,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55790862,Orlu Imo State: Rochas Okorocha agaala Orlu sị ha ka 'Ọzọemena!',"Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri.","Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara. O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu. Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara. N'ọnụ ya ""Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"" Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu. Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta. Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ. Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara? BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. Ka o si gaa n'Orlu n'ụbọchị nke atọ Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu. Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi. Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a: Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe. O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata. Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi. O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara Orlu Crisis: ""Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"" Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha. Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua. BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi. Lee mmadụ ole nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Orlu ụnyahụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ. O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ . Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua. Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua. Ma ndị ọrụ aka apụtaghị ọrụ taa dịka anyị si chọpụta Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a. Lee ihe Nnamdi Kanu kwuru maka ihe na-eme n'Orlu Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na ""Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ"". O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu. O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na ""Hague"". Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands. ""Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a"" - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ. Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ. Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara. O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a. Ebe ndị mmachi a metụtara bụ Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ. Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ. O kwuru sị ""ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa. O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ. O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme. Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu. Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya. Kedụ etu ọgbaghara a si bido? Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu. Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé. Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep. Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ. Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka. Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ. Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere. Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere. Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ. Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ." media-43098668,https://www.bbc.com/igbo/media-43098668,BBC IGBO: Mgbasa ozi ọhụrụ na-akwado mmalite,Ndị ntaakụkọ BBC na-akwado mmalite mgbasa ozi ọhụrụ n'asụsụ abụọ bụ Igbo na Yoruba n'ubọchị Eke (Monday) bụ Febụwarị 19.,"Peter Okwocha sokwa na ndị na-akwado mgbasa ozi ọhụrụ nke a Ọnụ na kwuchitere BBC na Naịjirịa bụ Peter Okwoche kwuru na mgbasa ozi ọhụrụ nke a ga-emetuta ndị mmadụ ọhụrụ. O kwuru nke a oge ọ pụtara n'ihe nkịrị ụlọ ntaakụkọ Channels a kpọrọ 'Sunrise' Ugbua, BBC na-agbasa ozi na Bekee, Hausa na Pidgin n'ala Naịjirịa. Okwocha kwuru, ""Anyị na-eme ihe a maka ikwalite asụsụ Igbo. Nchọpụta UNESCO mere gosiri na-asụsụ Igbo na anyụ ka ọkụ."" ""Echiche anyị bụ n'asụsụ Igbo ga-aputa ọfụma ofụma"" Kedu ihe bụ olileanya BBC Igbo? BBC Igbo BBC na-agbasa ozi n'asụsụ dị icheiche ihe karịrị iri atọ n'ụwa niile." afirika-45931530,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45931530,Atiku bụ Bureau de Change - Mbaka,Ụkọchukwu Ejike Mbaka kpọrọ Atiku 'Bureau de change' n'ihi ụdị ego igwe akụkọ kwuru banyere ndị mmadụ n'aka n'oge PDP mere ntuliaka imeụlọ ha na Portharcourt.,"Mbaka kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ozi chukwu n'ụlọụka ya bụ 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu. N'okwu ya ""Ọ bụrụ na Buhari bụ 'change' Atiku n'onwe ya bụ 'Bureau de change'. O kwuru na Atiku ga-emeri Buhari na ntuliaka afọ 2019, kama ka ọ ghara isoro nzọm ụkwụ Buhari. Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 Onye ụkọchukwu a rịọrọ ka uche Chineke mezuo n'ebe Naịjirịa nọ. O kwuru na Buhari were ohere ọma Chineke nyere ya tufuo n'efu site n'ịkpa oke agbụrụ n'inye ndị Naịjirịa ọrụ. Cheta na Mbaka n'afọ 2015 dọnyere Buhari ukwu ebe o kwuru na ọ ga-emeri na ntuliaka nke afọ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49562058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49562058,"South Africa Xenophobia: 'Ụmụ Nigeria dere du, anyị na-eleba anya na nsogbu a' - Buhari",Ụlọọrụ na-anọchite anya ụmụ Naịjirịa na Saụt Afrịka ekwuputela ihe ha na-eme gbasara mwakpo ọhụrụ e mere ụmụ Naịjirịa na mba ahụ.,"South Africa Xenophobia: Ndị Naịjirịa bi na South Africa ekeela nkwụcha N'ime akwụkwọ onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Kabiru Bala degaara ndị ntaakụkọ, o kwuru ihe ole na ole ha na-eme iji kwụsị ọdachi a. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtara n'akwụkwọ ozi ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44197278,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44197278,Olisa Metuh adala n'ụlọikpe dị n'Abuja,Onye bụbụ onye ode akwụkwọ mgbasa ozi pati nọ bụ n'ọchịchị bụ nke akpọrọ Peoples Democratic Party n'asụsụ Bekee bụ Oliseh Metuh dara n'ime ụlọikpe ka ikpe ya malitere tata.,"Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ Ihe a mere na ụlọipke ukwu dị n'Abụja taa bụ Monde, ụbọchị 21 nke ọnwa Mee. Metuh nọ n'ụzọ ị ga ebe a na-akpọsa ndị a na-ekpe ikpe mgbe ọ dara. Ọkaikpe kwụsịrị ikpe ahụ inye ohere ka ndị ọrụ ahụike leta ya ahụ. Gọọmentị kpụgara Metuh ọlụikpe ka ọzara ọnụ ya banyere nde naira 400 ha sị metụtara ego onye bụbụ onye ndụmọdụ Naịjirịa bụ Sambo Dasuki. Na ọnwa Febụwarị n'afọ a Metuh gara ụlọikpe n'elu akwa ụkọọgwụ. Emeka Etiaba, bụ ọkaiwu Metuh gwabụrụ ọkaịkpe na onye ọ na-anọchite anya agaghị abịalị ụlọikpe mana ọkaiwu sị ya bịa. Metuh gakwara ụlọikpe n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ịrịọ ohere ị ga mba ofesi maka ọgwụgwọ, mana ụlọikpe ahu ekweghị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50956010,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50956010,Ihe 6 mere ka 2020 pụọ iche,Ọ fọrọ awa ole na ole tụpụ anyị abanye afọ 2020.,"Dịka i na eme njikere maka afo ọhụru a, lee ihe isii ikwesiri ị ma maka afọ a. Ọgbakwụnyere otu ụbochị End of Twitter post, 1 N'ọgụgu ụbọchị afọ dịka ndị bekee sị agụ ya, afọ 2020 gbakunyere otu ụbọchi. Nke pụtara na o nwere mkpụrụ ụbọchị nari atọ na iri isii na isii. Nke a bụ nke ndị bekee na-akpọ 'Leap Year'. Ihe ga-eme n'igwe Ọ bụ na afọ 2018 ka ahụsoro ọnwa na-acha anụnụ Ọnwa na acha anụnụ anụnụ ga-apụta n'eluigwe n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Oktoba Nke dịka ibe ya, a ga-enwe mkpuchi anyanwụ bụ nke Bekee kpọrọ 'Solar Eclipse' n'abalị iri abụo na otu nke ọnwa Jun. Mana ọ bụ ndị mba Etiopịa, Ọman na Tibetị ga-ahụ nke a. A ga-enwekwa mkpuchi ọnwa (Lunar Eclipse) ụgbọro anọ n'afọ 2020. Mana ọ bụ naanị ugboro atọ ka a ga-ahụ ya n'Afrịka. Nke mbụ bụ n'abalị iri nke ọnwa Jenụwarị (Wolf Moon Eclipse); nke abụọ bụ n'abalị ise nke ọnwa Jun, ebe nke atọ bụ n'abalị ise nke ọnwa Jụlaị (Thunder moon Eclipse) Egwuregwu Olịmpịk Mba Japan ga-eme emume Olịmpik N'obodo Tokyo dị na mba Japan ka a ga-eme emume egwuregwu olimpik nke afọ 2020. Ihe karịrị mba narị abụọ nakwa mmadụ puku iri na otu ga esonye n'egwuregwu a. Egwuregwu a ga-ebido site n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọstụ ruo abalị isii nke Sepụtemba. BREXIT Ọ bụ na ụbọchị 31 nke Jenuarị ka ndị mba Ịngland ka apụ n'Iropịan Yunịọn Ọnwa Jenụwarị afọ 2020 gbaa mkpụrụ ụbọchị 31 ka mba 'United Kingdom' kwuru ha ga ahapụ otu Yuropịan Yunịọnụ. K bugharịrị ụbọchị ọpụpụ ha site n'ọnwa Machị gaa Ọktoba afọ 2019, tụpụ ha etinye ya n'ọnwa Jenụarị. 5G A na-atụ anya na 5G ga ebiri ọku n'afo 2020 Ị chetara na ọ bụ n'afo 2019 ka ụfọdụ ndi ụlọọrụ na-ere Ịntanetị bidoro ire 5G nke na eme ka igwe Intanetị dị ọsịsịọ? Kama dịka ụlọ ntaakụkọ FORBES na-akọwa na ọ bụ na afọ 2020 ka Igwe 5G nke Intanetị ga-eju ma bara abara. Ufọdụ Igwe ihe ndị Google ga-ewepụ n'afọ 2020 Ndị ụlọọrụ 'Google' na-akwado imemile ụfọdụ ngwa ọrụ na Igwe eji mara ha. ha gunyere Ego mmanụ agbidi Mmanụ agbidi na-enye otutumba ego Ngalaba ụloakwụkwo na-ahu maka akụnaụba uwa bụ 'Institute of International Finance' na-akowa na egọ eji egote mmanụ agbidi ga agbadata. Ha kowara na ihe ga-ebute nkea bụ n'ihi etu ndị mba Amerịka, Kanada na Brazịl si egwuputa mmanu agbidi n'ike n'ike. Ha na-atụanya na ọ ga abụ ihe dịka karama mmanụ agbidi nde na ọma itolu ka a ga na emepụta uwa niile kwa ụbọchị. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: 2019 in summary: Were anya gị gba nkiri" egwuregwu-52405093,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52405093,Covid-19 n'otu nkeji: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus?,Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina gwara ndị obodo ha ka ha na-aṅụ mmiri ọgwụ e ji Artemisia na ahịhịa ndị ọzọ wee mee iji gwọọ ọrịa coronavirus.,"Mana otu 'World Health Organisation' nakwa ngalaba ahụike mba ahụ ekwuola na onweghi nnyocha gosiri na ya bụ mmiri ọgwụ na-arụ ọrụ. Onyeisiala Madagascar bụ Andry Rajoelina na-egosi ndị be ha ọgwụ ọ sị na-agwọ coronavirus, mana otu WHO ekwuola na nke ahụ abụghị eziokwu Nnyocha dị icheiche ka na-aga n'ihu n'akụkụ ụwa niile iji chọpụta ma a ga-ahụ ọgwụ nke ga-arụ ọrụ. Ka ọ dị ugbua, onwebeghi ọgwụ nke e wepụtarala. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi" afirika-43375001,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43375001,Tillerson ezutela Buhari na Abuja,Odee akwụkwọ mba Amerịka nọ n'ime nzụkọ ya na Buhari maka ọtụtụ ihe dịka oke mmadụ na nchekwa; ihe ndị dị mkpa na ndụ ndị mmadụ,"Tillerson ebe o feturu n'ọdọ ụgbọala Nnnamdi Azikiwe Ala Naịjiria bụ ala ikpeazụ Tillerson ga-eleta ebe dịka ọ na-eme njem ala ise n'Afrịka ịkpa ihe dị iche iche metụtara obodo ndị ahụ. Tillerson kwadoburu ịlahụ n'Abuja laghachie echi mana ọ ga-alaghachị n'abali taa maka ọrụ mberede dapụtara ya n'ala ya. Cheta na Buhari gara Benue taa ịga leta ndị mmadụ ọgụ dị n'etiti ndị ọrụụgbo na ndịọchịehi metụtara. Lee ihe onyonyo mmadụ setere maka ọbịbịa ahụ: End of Twitter post, 1 Lee ihe ndị ọzọ na-ekwu maka nlaghachi ya: Akụkọ ihe nzụkọ ha ga-amịpụta na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-45035680,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45035680,Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ,"Na mkparịtaụka Ikechukwu Uche bụ Nwafọ Igbo na-agbara Naịjirịa bọọlụ na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu njem ya jiri malite n'ịgba bọọlụ.","Uche kwuru na o bidoro mgbe ọ dị na nwata malite ịgba bọọlụ, ebe ọ buru ụzọ gbara otu Iwuanyanwụ bọọlụ tupu ọ gaa mba Spen bụ ebe ọ na-agba bọọlụ ugbua. O kwuru na ebumnobi ya bụ ịgbara Naịjirịa bọọlụ nke bụ mgbe akpọrọ ya, obi dị ya ụtọ nke ukwuu. Uche kwukwara na nwanne ya nwoke bụ Kalu Uche nyeere ya aka dịka o ṅomiri ya n'ịgba bọọlụ. Ọ nyere ndị na-agba maọbụ chọrọ ịgba bọọlụ ndụmọdụ, kwuo na ọ bụ nrubeisi n'ala ka-eji agba bọọlụ nke ọma. ""Ọ bụ eziokwu na nne na nna m chọrọ ka m gụọ akwụkwọ mana a hụtara m onwe m n'ịgba bọọlụ. Agbanyeghi na ha anọghị ya ugbua, ebe ọbụla ha nọ, obi ga-adị ha ụtọ nke ukwuu."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50285633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50285633,Nnamdi Kanu: 'Ụzọ m sị gbapụ na Naịjirịa adịghị nfe',"Nnamdi Kanu agwala ndị ntaakụkọ etu o si zọọ isi onwe ya mgbe ndịagha Naijirịa biara iwakpo ya n'afaraukwu, Ụmụahia, Abia steeti.","Lee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha: Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa N'aka nke ọzọ, Nnamdị Kanu site n'aka ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, gwara ụlọikpe Naijirịa na ọ dị njikere ịbịa zara ọnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-echekwa ya. Mana ọkaiwu gọọmentị bụ Labaran Shuaibu ekwenyeghi na nke ahụ, bụ nke mere Ọkaikpe Nyako ji buga ikpe ruo ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2020. Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya Akụko ga-amasị gị" 43620283,https://www.bbc.com/igbo/43620283,Winnie Madikizela-Mandela: Onye ka nwaanyị a bụ?,"N'agbanyeghị na alụmdinanwunye ya na Nelson Mandela mechara gbasaa n'afọ 1992, Winnie nọrọ chịm n'ime ndụ di ya - soro ya pụta n'ụlọmkpọrọ, ha abụọ jidere aka n'afọ 1990 ka Mandela nọchara afọ 27 n'ụlọmkpọrọ.","Winnie mụtara ụmụ abụọ oge ya na Nelson Mandela bụ di na nwunye A maara ya na Mandela (a na-etu Madiba) dịka ndị na-alụ ọgụ megide ịkpa oke agbụrụ n'ime ihe ruru afọ iri atọ. Winnie ka bụ nwaagbọghọ nọ na mbido afọ 20 oge ọ pụtara ihe n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mana n'afọ ndị sotere ya, o mechara bụrụ onye a na-enyo enyo gbasara ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị. Oge ọ dị ndụ, Winnie so n'otu ndị bidoro otu pati ọchịchị ndị Saụt Afrịka bụ ANC. Akụkọ ga-amasị gị Ọnụ na-ekwuchitere ezinaụlọ ya bụ Victor Dlamini kwuru na Oriakụ Mandela ""nwụrụ n'udo ebe ezinaụlọ ya gbara ya gburugburu n'ehihie taa bụ Mọnde"" ka ọ rịatechara ọrịa aka. Ihe ndị ọzọ gbasara Winnie Mandela A mụrụ Winnie n'afọ 1936 na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Cape nke a mabu dịka Transkei. Ọ mụrụ ọrụ dịka onye ọrụ ebere nke bekee kpọrọ social worker, ma zute Nelson Mandela mechara bụrụ di ya n'afọ 1950. Ha biri dịka di na nwunye afọ iri atọ na asatọ (38). Winnie so di ya buso ịkpa oke agbụrụ agha ihe ruru afọ iri atọ, n'agbanyeghị na ha abụọ anọkọghị ọnụ oge ọbụla maka na Mandela nọ n'ụlọmkpọrọ. Ọ lụrụ agha a ọfụma mere e ji mara ya ọfụma na gburugburu ụwa dịka onye ọnụ siri ike gbasara ya. Winnie Mandela n'ihu ụlọikpe ụbọchị amara Mandela ikpe nga mkpụrụ ọka Dịka di ya bụ Nelson Mandela, Winnie mechara gaa ụlọmkpọrọ maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'etiti ha na ndị ọcha na-achị Saụt Afrịka mgbe ahụ. Emechara kpọọ ya aha ọjọ maka ụfọdụ ihe ndị o mere, dịka oge ọ kwadoro ihe bekee kpọrọ ""necklacing"" bụ ka a na-anyanye ndị a na-enyo enyo ịbụ ndị mgbaama taịa moto n'olu, n'ebe afọ 1980. Ha bokwara ya ebubo ịtọ mmadụ, ma maa ya ikpe ịga nga afọ isii oge a sị na aka ya dị n'ọnwụ otu nwata onye oyiegwu aha ya bụ Stompei Seipei dị afọ iri na anọ (14); ọ gọrọ ebubo ndị a. N'agbanyeghị na Mandela kwudosiri ike n'akụkụ ya ka a na-ebo ya ebubo a, alụmdinanwunye ha mechara gbasaa ka afọ abụọ gachara ka o si na mkpọrọ pụta. Ọ kwụsịghị ịza aha Mandela ma bụrụkwa ezigbo enyi ya, n'agbanyeghị na ọ gbara ya alụkwaghịm n'ụlọikpe n'afọ 1996. Winnie na Madiba ụbọchị o si na mkpọrọ pụta Ndị kwuru okwu maka ọnwụ ya Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala Saụt Afrịka kwuru ""dịka mama Winnie si nwụọ ugbua, otu onye n'ime ndị anyị ji eme ọnụ anwụọla. O so na ndị na-agwa anyị ka o si dị, anyị agaghị echefu nduzi ya."" Desmond Tutu riturula n'ọkwa ọchịchị Archbishop kwuru sị ""obiike ya ba etu o siri kwudosie ike n'ọgụ mmegide ịkpa oke agbụrụ bụ ihe ịkpalite mmụọ nye m na ọtụtụ ndị na-alụ ọgụ maka ike dịịrị onye.""" afirika-45469942,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45469942,Onye bụ Charles Ogbu m ga-eji saa ya okwu? - Femi Adesina,Aha Charles Ogbu nọ n'ezi ọzọ.,"Ugbua ọ bụghị ezigbo oku ka a na-akpọ ya. A na-akpọ ya maka akwụkwọ ozi o zigara onyeisiala Muhammadu Buhari bụ nke o tinyere n'akwụkwọ ntaakụkọ Sahara Reporters. Isiokwu Charles Ogbu na ya bụ akwụkwọ bụ maka ihe Buhari kwuru na mgbe ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na otu. Charles Ogbu sị na Onyeisiala bụ odibo ndị Naịjirịa BBC kpọtụkwara Charles Ogbu sị ya waara anyị ya bụ ikoro eze. N'ozi ya, onyeisala Buhari kwuru na agaghị ekwe ịdịnotụ Naịjirịa ọnụ. Ṅ'ime ya, Buharị kpọrọ ndị Naịjirịa ""my dear citizens"", bụ nke gbarụrụ Charles Ogbu afọ nke mere o jiri chetere onyeisiala na ọ bụ ojeozi ndị ọ na-achị nke bụ na o kwesiri ịkpọ ha ""fellow citizens"" na bekee. Charles sị na ụdị okwu ahụ gosiri mpako onyeisiala Buhari. Charles Ogbu dere ọtụtụ ihe na ya bụ akwụkwọ ozi o degara onyeisiala Buhari. Leekwa ya ebe a ma bekee. BBC Igbo kpọtụkwara Femi Adesina bụ ojeozi n'ihe mgbasara mgbasaozi nke onyeisiala Buhari ịmata ma ọ hukwara ya bụ ozi . Lee ihe ọ sara: Femi Adesina si na onweghị ihe Charle Ogbu pụtara ị sa ya okwu." egwuregwu-53467193,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53467193,Manchester United vs Chelsea: E gosila Man Utd na onyeisi nkwọcha anaghị aga ọgụ okwute,Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea ejirila iwe mekpaa ndị Manchester United ahụ oge otu abụọ a zutere onwe ha na mgbede ụbọchị Sọnde.,Ọkpụ goolu atọ a satara otu ka ha ji merie ha ma gafee n'agba ikpeazụ nke iko FA. David De Gea bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'asọmpi a n'ihi aka mbe o chere ugboro ugboro nke mere e ji merie ndị Man Utd. Olivier Giroud na Mason Mount nyeteere Chelsea goolu ebe Harry Maguire ji aka ya gbakpuo bọọlụ na neetị ndị Man Utd iji mezuo ya ọkpụ atọ. Bruno Fernandez ji penariti nyetere Man Utd otu mkpụrụ goolu nke ha ji gbaa aka ahịa. Ọ bụzị na Chelsea na Arsenal ga-agba asọmpi nke a gbachaa e buru n'iko FA. Cheta na Arsenal nyụrụ Manchester City ịkpakwụ n'ụbọchị Satọde. Ọkpụ abụọ asataghị asata ka Arsenal ji merie Man City. afirika-48706966,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48706966,"Suspension of 27 Imo LGA chairmen, councillors: 'Ihe mere anyị ji gbaa Ihedioha akwụkwọ n'ụlọikpe'","Ndị kaụnselọ 604 dị n'okpuru ọchịchị 27 a chụrụ n'ọrụ n'ike n'Imo akọwaala na ihe mere ha ji gbaa Gọvanọ Emeka ihediọha akwụkwọ n'ụlọikpe bụ n'ihi na ""o megidere iwu Naijiria"" site na ịchụ ha n'ọrụ.""","Ndị kaụnselọ okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa a chụdara n'ike n'Imo steeti kpụpụrụ aka na-achị gọvanọ steeti ahụ bụ Emeka Ihedioha na ndị omeiwu steeti ahụ n'ụlọikpe ukwu nke etiti nọ n'Owere. Ha na-agbagha ọchụchụ n'ọrụ nke a chụrụ ha n'abali atọ nke ọnwa Juun afọ dịka ụlọomeiwu steeti ahụ siri kpebie ma were kọmịti nlekọta anya dochie ha. Otu onye na ime ndị kaụnselo ọ metụtara bụ George Uke gwara BBC Igbo na ya bụ ihe bụ ""ihe ụlọikpe kachasị kpebiriela dịka ha kagburu mkpebi Ụlọomeiwu nke steeti ahụ kpebiri."" Uke, onye bụ otu n'ime ndị kaụnselọ n'Okpuru Ọchịchị Ideatọ-North, sị: ""Etu gọọmenti etiti enweghị ikike ịchụlị ndị a họpụtara na ntuliaka dịka ndị gọvanọ n'ọrụ, ndị gọvanọ enweghị ikike ịkwusị ndị kaụnselọ ọrụ."" Uke onye kwuru na ọ bụ n'afọ 2021 ka ha kwesiri ibi ọrụ ha, kwuru na o nweghị mgbe e nyere ha akwụkwọ na a chụrụ ha n'ọrụ. ""A chọọ ịchụ n'ọrụ, a ga enye gị akwụkwọ ga-ekwu na a chụrụ na ihe kpatara ya, mana o nweghị akwụkwọ ịchụ n'ọrụ anyị hụrụ."" ""E jighị ịma ọkwa achụ mmadụ n'ọrụ."" O gara n'ihu kọwaa na ha enwetala ntuziaka ụlọikpe si ha bido ọru ganye mgbe e biri ikpe ahụ. O kwuru na ha ihe nwere ike ibute ọgbaghara na ssteet ahụ dịka ya bụ ihe metụtara ndị APC, ebe ndị ọhụrụ bụcha ndị PDP. ""Ha chọrọ iji okwu 'suspension' meghaa ndị mmadụ anya."" Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-44120771,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44120771,Otu egwuregwu Naịjiria ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 n'ọnwa Mee,Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru ịsonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ.,"Naịjirịa na mba Congo, England na Czech ga-asọ mpi enyi na enyi tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti. E nyere ha rue ụbọchị 21 nke mee iji rute n'ọgbọ egwuregwu ahụ iji bido nkwado ha. Ha nwekwara ụfọdụ asọmpị iji kwado dịka Amanju Pinnick na-ekwu na nke ha na mba Congo ga-aga n'ihụ agbanyeghị ọrịa Ebola na efee n'obodo ha. Cheta na onye nkuzi otu ha Gernot Rohr akpọọla aha ndị ọgba bọọlụ 30 ga-esonye n'asọmpị iko mba ụwa a na Rọshịa. Lee ebe otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ gosiri aha ndị ga-anọchite anya Naịjrịa n'elu soshal midia: Akụkọ ga-amasị gị:" 49104945,https://www.bbc.com/igbo/49104945,Nnewi Women: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?,"Nnewi, Anambara steeti bụ obodo na-ewu ewu maka ndị nwere agba si ya pụta dịka Innocent Okeke (Innoson), Cosmas Maduka(Coscharis), Ibeto, Ogbuawa na ndị ọgaranya ọzọ.","Mana, ihe ọzọ e ji mara Anaedo bụ ‘Nwaanyị Nnewi’. Nke a bụ ihe e jiri mara ọgbatutum ụmụnwaanyị ndị Nnewi na-agbakarị. Ọgbatumtum ụmụnwaanyị na-ewu ewu na Nnewi nke na ọ hịara ahụ ịhụ ezinaụlọ Nnewi ọ dịghị. A mara ụmụnwaanyị Nnewi maka ịgba mbọ mana ọtụtụ amaghị na ọ bụ ọgbatumtum bụ ihe na-akụrụ ha nkwa ha na-agba. Ụmụnwaanyị Nnewi ji ngala akwọ ya dịka ha ji ya aga ahịa, ugbo, akwamozu,ụka na mkpa dị ọzọ dịrị ha. N’ihe onyonyo, ụmụnwaanyị ndị Nnewi kọwara BBC Igbo ‘sacrament jikọrọ ha na ọgbatumtum:" afirika-49996784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996784,Sex for Grades: Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha,Mahadum Rivas Steeti akara ekwentị maka mkpesa,"Akụkọ dị mkpa: Mahadum Rivas Steeti dị mbụ nwee ukporo iwu ụmụakwụkwọ ga-eji mee mkpesa banyere nke a mana ụjọ anaghị ekwe ha mee ya. Mahadum Rivas Steeti ewepụtala akara ekwentị ebe ụmụakwụkwọ ga-eme mkpesa maka ndị nkuzi na-achọ idina ha. Nke a na-abịa n'ime ụbọchị atọ BBC wepụtara akụkọ maka nyocha ndị nkuzi mahadum na-edina ụmụakwụkwọ na mpaghara Afrịka (Mahadum Legọs na Gana). Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi mahadum a bụ Ọkammụta Opuenebo Binya Owei gwara BBC na ọ bụ ka ụmụakwụkwọ nwee ike ịkpọpụta ndị nkuzi na-akpa ụdị arụ a. Ọ sị na ihe mere o ji bụrụ ihe nzuzo bụ ka ụmụakwụkwọ ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ha kpọọ onye nkuzi aha. Mahadum a so na dị a kpọrọ aha na soshal midia ka e nyocha ndị nkuzi ha maka idina ụmụakwụkwọ. Buhari na Jonathan Zutere n'Aso Rock taa: Ihụkwara Foto Onyeisiala Muhammadu Buhari na Goodluck Jonathan ebe ha na-ekwe n'aka na-achị ọchị n'Asọ Rock. Nke a mere mgbe Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa nyefere Buharị ọchịchị n'aka gara n'isi ọchịchị Naịjirịa dị n'Abuja. O nweghi onye mara ihe bụ isi mkparịtaụka ime ụlọ ha mere were nkeji iri dịka Jonathan. Nke a butere ọtụtụ okwu na soshal midia nke otu onye na Facebook sị na 'ọ dịka Jonathan ọ chọwala ịbanye APC'. Na Sudan Nwada Neemat Abdulllah abụrụla onyeisi ọkaikpe nwaanyị mbụ na Sudan Ọ dịla anya ọtụtụ mmadụ na-achọ ka e nyekwuo ụmụnwaanyị ọkwa dị elu na mba ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma' 'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia Ụgbọala Innoson Motors BBNaịja bunyere Mercy Dịka Mercy Eke, onye e ji Lamborghini wee mara nwetachara mmeri n'egwuregwu Big Brother Naija, okwu gbasara ihe nrite e nyere ya ka na-ewu na sosha midia. Mercy ritere ego dị nde naịra iri atọ na ihe nrite ndị ọzọ ọnụ ego ha ga-erukwa nde naịra iri atọ. Otu n'ime ihe nrite ndị a bụ ụgbọala Innoson Motors. Mana otu onye a ma ama na soshal midia bụ Tunde Ednot kwuru na Innoson Motors e bunyere Mercy ekwesighị ekwesị. Ednut kwuru na ya che na a ga-ebunye Mercy ụgbọala 'G-wagon' maọbụ 'Range'. Mana Ednut mechara wepu ihe ahụ o dere n'akara 'intsgram' ya. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe ahụ Ednut kwuru. Ha sịrị na ọ magburu onwe ya bụ ụgbọala Innoson Motors e bunyere Mercy n'ihi na ọ ga-enye aka ịịkwalite ụgbọala a rụrụ na Naịjirịa. Mana ụfọdụ na-ekwu na ụgbọala ahụ erughị nde naịra iri abụọ na ise bụ ego ole ndị BBNaija kwuru na ha zụrụ ya. Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru: @DrJoeAbah kwuru na ọ zụrụ ụgbọala Innoson n'ihi na ọ dị mma. @realVirusMedia kwuru na ọdịghị ya ka ụgbọala ahụ e bunyere Mercy eruru ego ole e kwuru na a zụrụ ya. @youngsam_my kwuru na ụgbọala Innoson Motors zuru ka e mee. Ụlọọrụ Innoson Motors tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ. He kwuru na ha na-agba mbọ ịkawanye mma dị oge na-aga. N'akụkọ ọzọ Dịka BBC gbachara ndị nkuzi mahadum na-achọ idina ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị n'anwụ, ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itule iwu ọhụrụ ga-eme ka onye ọbụla mere ụdị omume ahụ ọzọ gaa nga afọ ise. Onye na-akwado iwu a bụ Ovie Omo-Agege onye bụ osote onyeisi Senate ma bụrụkwa sịnetọ na-anọchite anya Delta Central n'ụlọomeiwu ukwu. N'ofesi Nabil Karoui na-ekele ndị nkwado ya Ụlọikpe na mba Tunisia atọhapụla Nabil Karoui bụ onye so azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ ụbọchị ụka. Karoui nobu na mkpọrọ n'ihi ebubo nrụrụaka na iji aghụghọ zere ịtụ ụtụisi, mana ọ na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha. N'egwuregwu Aha a na-akpọ ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa na-erubeghị afọ iri na-asaa bụ 'Golden Eaglets'. Ndị otu egwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghị afọ iri na asaa agawala mba Brazil iji sonye n'asọmpi iko mba ụwa maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa. Asọmpi a ga-ebiri ọkụ bido n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba ruo abalị iri na asaaa nke ọnwa Novemba. Naịjiria nọ n'otu B n'asọmpi nke afọ a Naịjirịa abuola iko mba ụwa ndị na-erubeghị afọ iri na asaa ugboro ise. Ha gunyere nke afọ 1985, 1993, 2007, 2013, na 2015. Naịjirịa, Họngarị, Ekuadọ na Ọstrelia nọ n'ọtu B n'asọmpi nke afọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Gịnị ka ị ma gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị?" afirika-51373401,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51373401,Police Brutality: Etu ndị uweojii si kụpụ onye otu anyị mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maka ọrụ ya,Otu na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị a kpọrọ Women's Aid Collective (WACOL) ngalaba Enugwu na ndị otu ndị ọrụ ndị ọzọ na-ekwuchitere ọhaneze ọnụ ha mere ngagharịiwe maka agwa ọjọọ ha sị na ndị uweojii 'Area Command' kpasịrị ha.,"Onyendu ha bụ Joy Ezeilo kọwara na otu nwagbọghọ ji anya mmiri gbata n'ụlọọrụ ha ma sị ka e nyere ya aka n'ihi otu nwaokoroọbịa dinara ya n'ike. Nke a mere ndị WACOL ji buru mkpesa nwagbọghọ a gaa n'aka ndị uweojii site n'aka onye ọkaiwu ha bụ Goodness Ibangah. Dịka a ka na-eme nyocha dị n'ime ya, nna nwaokoroọbia ahụ e chere na ọ kpara ego na ndị uweojii bidoro ịrịọ nwagbọghọ ahụ na ndị WACOL ka a kwụsị ikpe a. Mana ndị WACOL gwara ha na ọ bụghị ha ka ọ dịrị ịkwụsị ikpe ahụ na-aga n'ihu. Ezeilo kwuru n'ụbọchị 30 ọnwa Janụwarị, ndị uweojii mmadụ anọ bịara n'ụlọọrụ WACOL n'Enugwu, tie ọkaiwu Goodness Ibangah ọ nọ ndụ ọnwụ ka mma. Ọ sị na ndị uwojii kpụkwara ya gaa n'ụlọọrụ ha nke 'Area Command' mgbe ha kụchara ya ihe. Dịka ha hụrụ na nwaanyị a achọwala inwụ, ha ji ọsọ gaa dowe ya n'ụlọọgwụ 'National Orthopaedic' dị n'Enugwu. Ndị ọrụ enyemaka ahụ na-ekwu kwa na ndị uweojii kwụsị ị chụgharị ha bụ ndị na-enyere ndị mmadụ aka Nke a mere ndị WACOL na ndị ogbo ha bụ otu Coalition of Eastern Non Governmental Organisations (CENGOS) jiri mee ngaghariiwe na gburugburu Enugwu megide ndị uweojii. Ezeilo duru ndị otu ya gakwa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu bụ ebe ha nyere kọmishịọna ndị uweojii akwụkwọ mkpesa ha. Mana ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe sị na Kọmishịọna uweojii bụ Ahmad Abdulrahman ehiwela kọmitii ga enyocha etu ihe niile ji mee. Ndukwe gwaara ndị WACOL ka ha ghara ịdị na ebuli okwu elu kama ka ha hapụ ndị uweojii ka ha rụọ ọrụ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-50198707,https://www.bbc.com/igbo/media-50198707,Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke,Ọyị na ọyị na-atọ ụtọ bụ elete aghara!,Mana echeghị m na ọ bụ ntoroọbịa niile ka egwu a na-agara. Chọpụta ihe ụmụagbọghọ Igbo kwuru na ha nwereike maọbụ enweghị ike imere ọyị ha nwoke. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55355723,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55355723,Lee nwoke gburu ichi e ji mara ndị Igbo n'oge gboo,Odidika Chidolue dị afọ itoolu mgbe e gburu ya ichi n'obodo ha.,Ọ kọwara usoro e si gbuo ya ichi ahụ. O kwuru na o were ya ihe ruru elekere ise maọbụ isii mgbe egburu ya ichi ahụ. Gee okwu ya n'uju ebe a: afirika-51273068,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51273068,Nwaanyị na-alụ ọgụ iji kwụsị ụmụagbọghọ ịgba akwụna,"N'isi Obodo mba Congo DR, ịgba mgba enyere otu nwaanyị pụrụiche ikike ịgbanarị mpaghara ọjọọ ebe ọ nọ too.","Dịka onye mgba, Shaki bụ onye ọtụtụ ụmụaka na-akwanyere ugwu maka ọ na-enye ha ọzụzụ na okwuke. Ụlọ ya bụ ebe ọtụtụ umụaka na-enweghi ebe obibi bi ma bukwara ebe ndi na-achọ ịgbanarị ndị chọrọ iwakpo ha. BBC Africa Eye so Shaki banye ebe ọ na-agba mgba, na-alụ ọgụ iji nyere nwa ya nwaanyị ohere ibi ndụ. Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-45049554,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-45049554,Pope: Ụka Katọlik akatọọla ịma mmadụ ikpe ọnwụ,Pope Francis gbanwere nkuzi ndị Ụka Katọlik ka omegide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghi ihe ọbụla onye ahụ mere.,"N'oge gara aga Pope Francis kwuru megide ịma mmadụ ikpe ọnwụ Nkuzi ndị ụka ahụ n'oge gara aga kwadoro ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụfọdụ ihe onye ahụ mere. Mana ugbua onyeisi ụka ahụ bụ Pope Francis kwuru na ""ọ bụ ime mmadụ ihe ike nakwa mmetọ ugwu ruru mmadụ"". Ụka Kraịst ga-agba mbọ ka akachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụwa niile. Pope kwuru na-ekwesiri inye mmadụ ohere nchegharị na Chineke bụ onye kere mmadụ dị njikere ị na-aba onye nwere nchegharị. O kwuru na ụka Kraịst ga-agba mbọ ka akachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụwa niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48014817,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48014817,Jamb Results: I ji aghụghọ lee Jamb? Nyocha abịala,Akụkọ anọ dị mkpa n'ụtụtụ a,Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Iji aghụghọ lee Jamb? Obi mapụwakwa gị makana ngalaba ahụ na-ahụ maka ụle eji abanye mahadum sị na ha ga-amalite nyocha ga-esi 2009 ruo 2019. Onye is mgbasa ozi Jamb bụ Fabian Benjamin sị Onye asambodo Jamb ya bụ adịbogorja ga-agbara aka. A ga-enyocha ogbugbu mmadụ na Gombe Gombe ebe onyeisi ndi uweojii bụ Mohammed Adamu si na ha ga-eme nyocha banyere etu Ihe karịrị mmadụ iri na-enwe anụrị ncheta mbilite n'ọnwụ Jesu jiri nwụ mgbe ụgbọala Onye uweoji nya bara n'etiti ha. Akụgbụru onye uweojii ahụ na onye Civil Defence o bu mgbe ndị mmadụ wakporo ha ka ihe mgberede a mechara. Okorocha kwuru na Igbo na Ipob abụghị otu ihe Ọkaikpe esepụla aka n'ikpe Okorocha Ọkaikpe ọzọ esepụla aka n'ihe banyere ikpe asambodo Rochas Okorocha na-arịọ ụlọikpe ka ọ manye Inec inye ya. Ọkaikpe Okon Abang sị na ọ bụ akwụkwọ Okorocha degara onyeisi ya mere ya ji sepu aka. Chelsea na Burnley Chelsea bụzị ndị anọ Chelsea asorula na ndị na-aracha piọm na Premier League dịka ọkpụ abụọ ọkpụ ha na Burnley gbara ụnyaahụ nyere ha ohere ịrịgọ bụru ndi nke ato na tabụlụ. Gee nkeji a ebe a: Lee ihe nkiri anyị nke taa: afirika-52943318,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52943318,Ị ma na nsị gị na-egosi ahụike gị?,Ọ bụ na ị naghị aga mposi nke ọma? Ugboro ole ka ị na-aga kwa ụbọchị? Lee ihe ọkachara kwuru maka ịga mposi.,"Ụfọdụ na-ele ịga mposi anya ka ọ bụ ihe ọjọọ, nke bụ na ụfọdụ anaghị achọ ka a mara na ha na-aga mposi mana ọ dị oke mkpa na ndụ mmadụ, Igbo na-akpọ ya mposi. Ụfọdụ na-akpọ ya ọma, ebe ndị ọzọ na-akpọ ya ogweasọ. Ịhe ọbụla ụnụ na-akpọ ya, mata na ịga mposi bụ otu n'ime ihe kachasị mkpa n'ahụ mmadụ. Otu nwaanyi na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya sị na ya na-aga mposi otu ugboro n'izuụka abụọ. Toilet Posture:Lee ka ị ga-esi ga mposi ọfụma na-achịghị nsị Nwaanyị ọzọ si na ya na-aga nke ya otu ugboro n'izuụka. Mana, Dọkịnta Chinedum Aranotu bụ dọkịnta ahụike na University of Nigeria Nsukka sị na o kwesiri ka onye ọbụla na-aga mposi ihe dịka otu ugboro maọbụ ugboro abụọ n'ụbọchị. Ọ sị na ""ịga mposi otu ugboro n'izuụka nwereike ibutere mmadụ ọrịa dị iche iche"". Iji ghọta ka mposi sị dị mkpa n'ahụ mmadụ, ọ dị mma ịghọta ihe bụ mposi. Gịnị bụ mposi? Mposi bụ ihe eriri eri nke ahụ mmadụ anabataghị. Ihe dịka protin, nnu, nje na ihe ndị ọzo nke eririafọ mmadụ yọchara, na-abaghịzị uru n'ahụ, nke ahụ chụpụrụ achụpụ site na eririafọ. Akwụkwọ ahụike 'Healthline' si na ụdịdị maọbụ usi mposi dị iche dịka ahụ mmadụ si dịkwa iche mana ụdị ya nwereike igosi ka ahụike mmadụ dị. Ugboro ole ka mmadụ kwesiri ịga mposi? Akwụkwọ akụkọ 'Healthline' sị ka mmadụ sị aga mposi gosiri ka ahụike eririafọ ya dị. Chinedum Aranotu kwukwara na ""onye ọbụla na-eri ihe kwa ụbọchị kwesiri ị dị na-aga mposi kwa ụbọchị na-emeghi etu a nwereike ibutere onye ahụ ọrịa dị iche iche"". Dkt. Chinedum Aranotu sị na ịga mposi kwa ụbọchị dị oke mkpa n'ahụike mmadụ Enweghi ugboro ole kpọm kwem mmadụ kwesiri ịga mposi, mana ndị 'Healthline' sị na bido n'ugboro atọ n'ụbochị rụọ ugboro atọ kwa izuụka dị mma. Nyocha e dere n'akwukwọ mgbasaozi nke ""Scandinavian Journal of Gastroenterology"" kwadokwara nke a. Igbo kwenyere na ịga mposi n'ụtụtụ tupu ị saa ahụ maọbụ tupu nrị abanye gị n'afọ kacha mma, na ọ ga-enye ohere ka nrị ọhụrụ baa gị ahụ. Dọkịta Aranotu kwenyekwara na ịga mposị ụtụtụ kacha mma ma kwuo sị ""Onye ọbụla nwereike ịga mposi mgbe ọ gụrụ ya"". Ọ sị na ""mposi ụtụtụ ka mma maka na ọ ga-eme ka ahụ gị ghere oghe ịnabata nrị nke ụbọchị. Ọ ga-enyekwa aka ịme ka mmadụ jikere maka ọpụpụ nke ụbọchị ahụ ka mposi nsị ghara ịkpa ya n'ụzọ. World Toilet Day: Ka nwa gị ga-esi mụta ị ga mposi n'ọnwa isii Nyocha ndị 'Healthline' mere mmadụ 2000 gosiri na pasentị 50 n'ime ha na-aga mposi otu ugboro n'ụbọsị, ebe pasentị 28 na-aga ugboro abụọ n'ụbọchị. Mmadụ dị pasenti 5.5 na-aga otu ugboro kwa izuụka. Pasenti 61.3 na-aga mposi kwa ụtụtụ, pasentị 22 na-aga n'ihihie, pasentị 2.6 nke ọzọ na-aga n'abalị. Ndị ọkachamara na-akọwa na Chineke kere eririafọ mmadụ ka onweike ịhọpụtacha nje na nri ndị ọzọ ahụ mmadu achọghị n'abalị. Nke a mere mposi ji abịa mmadụ n'ụtụtụ mgbe onye ahụ biliri n'ụra, ọkachasị mgbe ọ ṅurụ oke mmiri maọbụ rie nri dị ọkụ. Ihe ndị nwereike ị nye aka ka mmadụ na-aga mposi kwa mgbe Nri - Iri ihe dịka agwa, na mkpụrụ ndị ọzọ, akwụkwọ nrị na mkpụruosisi nwereike ịnye aka ịga mopsị kwa mgbe. Ihe ọṅọṅụ nwekwara ike ịme ka mmadụ gaa mposi esighi ike.Afọ ole mmadu dị - Afọ ole mmadụ dị nwereike imetụta ka onye ahụ sị aga mposi. Ihe nwereike ibute nke a bụ maka na mgbe mmadụ anaghịzị agagharị nke ọma, ka eririafọ onye ahụ sị anabata nrị na agbada. Ịṅụ ọgwụ na-esokwa eme ka nrị ghara ịba mmadụ n'ahụ ka o kwesiri. World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ' Mmegherị ahụ - Etu mmadụ si emegharị ahụ na-enyekwa ka ịme ka onye ahụ na-aga mposi nke ọma nke Bekee kpọrọ ""peristalsis"". Ije nakwa ịmegherị ahụ nke ọma na'enye aka ime ka mposi na-apụ mmadụ n'ahụ ka o kwesiri. Ọrịa - Ọrịa ụfọdụ na-emekwa ka afọ mmachie mmadụ ike. Ọrịa ndị Bekee kpọrọ ""inflammatory bowel disease"" nakwa ""viral gastroenteritis"" nwereike ịmachi mmadụ afọ. Mgbe ụfọdụ ọgwụ ahụmgbu ụfọdu nwekwereike ịgbachi mmadụ afọ. Etu mposi nwereike iji gosi ka ahụ dị mmadụ Na nyocha e mere n'isi mmadụ dị puku abụọ (2000), healthline weputere ihe ha kpọrọ Bristol Scale nke na-enyeaka ịma ụdị nsị mmadụ nyụrụ na ihe o gosiri. Lekwa eserese ya ebe. Nke mbụ - Nsị kpụrụkpụru dịka okwute na-egosi na afọ gbachiri mmadụ ma na-esikwa elu mmiri. Ịwụchapụ ya na-ahịa ahụ maka na ụfọdụ ha anaghị ekwe apụcha mgbe awụrụ ya mmiri. O kwesighị ịna eme mgbe niile. Nke abụọ - Nsị dị ogologo gbujiri egbuji dịka egu gosikwara afọ mgbachi. Ụdị nke a na-esekwa elu mmiri. Ịnyụpụta ya na-ahịakwa ahụ maka ụdị nkụ ọ kpọrọ. O nwekwaraike ịmerụ mmadụ ahụ n'ike ma-akpachaghị anya. O kwesikwaghị ịna anyụ nke a mgbe niile. Nke atọ - Nke a toro ogologo nwechere ahịrị n'elu ya. Ụdị nke a na-adịkarị nfe ọnyụnyụ ọkacha ma ọ dịtụ nwa nlo (soft) ma hịakwaa ahụ ịkwopu mgbe awụrụ ya mmiri maka na o sere elu ma dịkwa ogologo. Ọ bụ dị nsị a ka ana akpọ agada gbachiri ụzọ maka ọ naghị ekwe ekwochapụ mgbe anwụrụ ya mmiri. Nke anọ - Nke dị ka agwọ bụ nke ndị ọrụahụike na-asị na ọ bụ ya ka mposi mmadụ kwesiri ịdị bụ nke mmadụ kwesiri ị na-anyụ kwa ụbọchị maọbụ ugboro atọ n'ụbọsị. Ọ na-adị nfe ọnyụnyụ maka na ọ dị nlọ, dịka ogologo na-apụ n'ike na-enweghị mgbachi ọbụla. Nke ise - Ụdị nke a na-agbakọ agbakọ mana ọnaghị ekeji ekeji. Ọ na-egosi na onye ahụ enweghị ""fibre"" n'ahụ. Ọ na-agbarikarị na mmiri ma ọ pụta. Mgbe ụfọdụ, ị hụkwa mkpụrụ nrị dịka agwa, maọbụ ihe ndị ọzọ onye ahụ riri. Nke isii - Ụdị mposị a anaghị enwe ihe oyiri eyi. Ọ naghị akwụdosi ike n'ala. Ọ na-egosi obere afọ ọsịsa. O kwesiri ka onye nyụrụ udi nsị a na-aṅụ mmịrị nke ọma. Nke asaa - Nsị mmiri mmiri bụ nke na-egosi afọ ọsịsa, nke pụtara na nrị anaghị anọ onye ahụ n'ahu. Onwere ihe agwa mposi mmadụ na-egosi? Mposi mmadụ na-agba ama dị iche iche. Ọ na-agbakwa ama onye ahụ dị na onye ahụ na-adịghị. Lee esere ese ya ebe a. A. Nke a na-acha ezigbo akwụkwọ ndụ; o gosiri na onye ahụ na-eri nrị akwụkwọndụ karịa. Nke a adịchaghị mma dịka ndị dọkịnta siri kwuo. B. Nke a na-achatụkwa akwụkwọ ndụ maka ọ karịghị. Nke a gosiri onye ahụ dị. C. Nke a na-acha ụrọ ụrọ gosikwa onye ahụ dị. D. Nke a na-eji oji gosikwara na ọnye ahụ na-aṅụ ọgwụ dị agha bụ nke nwere ayọnụ maọbụ na onye ahụ na-agba ọbara na mgbiri afọ ya ebe dịkara obi ya. E. Nsị dị ọcha gosiri na ọnụnụilu onye ahụ kpochiri akpọchị. Onye ahụ kwesiri ịga-ụlọọgwụ ozugbo. F. Nsị meemee gosiri na onye ahụ na-eri ihe dị meemee maọbụ na ọ na-agba ọbara na mgbada eriri afọ ya. G. Nke a gosiri na abụba karịrị onye ahụ n'ahụ maọbụ na ahụ ya anaghị anabata nrị ọfụma. Ajụjụ a na-ajụkara maka nsị Dkt. Aranotu zara ụdọdụ ajụjụ a na-ajụkarị. Kedụ ihe ọpụtara nsị mmadụ ise n'elu mmiri? Mgbe ụfọdụ nsị mmadụ na-ese elu mmiri nke gosiri na ụme adịghị ya. Otu nyochae e mere na-egosi na ikuku maọbụ mmiri karịrị onye ahụ n'afọ. Onwekwaraike ọ bụrụ na ahụ onye ahụ anaghị anabata nrị nke ọma, nke a nwereike igosi na afọ machiri onye ahụ. Gịnị bụ afọ mgbachi Bekee kpọrọ ""Constipation""? Mayo Clinic sị na ""constipation"" bụ agaghị mposi ihe dịka ugboro atọ n'izuụka. Lekwa ka o sị kọwa ya. Gịnị na-ebutekwanụ afọ mgbachi a? Ọtụtụ ihe nwereike ibutere mmadụ afọ mmachi. Ọ bụru na akwara nọketere nke Bekee kpọrọ ""Colon"" maọbụ ""Rectum"" nwee nsogbu, mposi onye ahụ nwereike isiike. World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ' Ihe ọbụla metutara ""Hormone"" mmadụ dịka afọime maọbụ nrị nwerike imetute mpsoi onye ahụ. Ọ bụrụ na ihụ udi ihe a na mposi gị, bido riwe akwukwọ nrị, mkpuruosisi na agwa na ndị otu ya. Ịṅụkwa mmiri na-emegharị ahụ ga-enye aka ka afọ gbasaa onye ahụ. Agbanyeghị na mposi mmadu nwereike isiike maọbụ dị nlo site na ụbọchị gawa n'ụbọchị, onye ọbụla afọ ya siri ike karịa abali abụọ kwesiri ịga ụloọgwụ. Afọ mmachi adịghị mma dịka oke afọ ọsịsa na-adịghịkwa mma. Nke a nwereike ịbụ mgbamma na ihe ọjọ na-abịa n'ihu, ya mere kee nkwụcha chebiri ya." afirika-56637409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56637409,Owerri Prison Break: Ọ bụghị ndị Ipob mere ihe mere n'Owerri - Hope Uzodimma,"Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agbaarala ndị otu nnwereonwe Biafra bụ ""Indigenous People of Biafra' a ma dịka Ipob n'ịchafụ, akaebe na aka ha adịghị na mwakpo ụlọmkpọrọ nakwa ogige ndị uweojii ndị ekperima na-awakpo aghara aghara na steeti ahụ.","Na mkparịtaụka ya na Ụlọntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde, Uzodinma kwuru na ọ bụ dị ndọrọndọrọ ọchịchị obi adịghị mma na-etinye aka enwe n'ofe, a na-ebo ya ndị otu Ipob. ""Ọ bụghị Ipob. Eee, anyị kwere na anyị nwere ndị Ipob obi adịghị mma. Mana m ga-agwa gị, ọtụtụ n'ime ndị na-emebi ihe ndị a niile bụ ndị e si ebe ọzọ kpọbata n'Imo steeti."" ""Ha (ndị ndọrọndọrọ ọchịchị) chọpụtara ihe bụ iwe ndị mmadụ n'otu ebe, ha gobiri ndị agboro si ebe ọzọ. Ha kpọbata ha ka na-eme ka ha abụ ndị Ipob, ha mee mpụ, ha agbalaga."" Uzodimma kwuru na ebumnobi ha bụ itinye ọchịchị ya na nke Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọgbaghara. Ndị bu egbe wakporo isiụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọmkpọrọ Owere mepere ndị nga karịrị otu puku ka ha gbawara ụbọchị Mọnde mana iri asatọ n'ime ha lọghachiri ụbọchị Wenezde dịka gọọmenti etiti kwere nkwa ịgbaghara ha ma ha lọghachi. Ihe ọma a ga-emere ndị si ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri gbapụ ọsọ ma ha lọghachite Rauf Aregbesola bụ mịnista na-ahụ maka ime obodo gara njem nleta n'ụlọmkpọrọ ahụ awakporo n'Owerri Minista na-ahụ maka ime obodo bụ Rauf Aregbesola arịọla ndị ahụ si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owere gbaa ọsọ n'oge ndị oji egbe wakporo ebe ahụ ka ha biko lọghachite. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem ileta n'Owere ma sị na a ga-agbaghara ndị ga-alọghachị, ahụhụ e kwesịrị ịta ha maka isi n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ. Lee ka o si aga n'Owere ebe osote onyeisiala wuchịrị n'okporoụzọ Dick Tiger dị n'Owere: Yemi Osinbajo, Osote onyeisiala Naịjirịa na Gọvanọ Hope Ụzọdịmma n'Imo steeti taata Kpochapụ ndị Ipob na ESN - Mohammed Adam bụbu Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa Owerri Prison Break: Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa si ka ekpochapụ ndị Ipob na ESN ""Kpochapunu ndị Ipob na ESN kpamkpam"" bụ okwu onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ IGP Mohammed Adamu mgbe ọ gara Owerri ileta ka mkpamkpa kpara ebe ahụ. Nke a na-abịa dịka awakpochara ụlọ mkpọrọ na isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị n'isi obodo Imo steeti. Mazi Raph Uwazuruike kwuru na onyeisi gburugburu ndi uweoji na nke commisioner imo state kwesichara igba arrụkwaghim maka mwakpo ụlọ mkpọrọ mere n'Owerri. Uwazuruike kwuru na ọ katọghi nwakpo ahụ mere na Owerri n'ihi na onweghi onye ọbụla e gburu. Ihe o kwuru n'uju dị ebe a: Ọ katọrọ ọchịchị Muhammadu Buhari tụmadi etu ha si eme ihe gbasara ngalaba nchekwa. Lee ka Owerri dị n'ụtụtụ ụbọchị abụọ dịka awakpochara ụọ mkpọrọ ebe ahụ Ndị mmadụ ebidola pụtawa na bee ha ị ga ebe dị iche iche n'Owerri dịka a awakpochara ụlọ mkpọrọ dị n'isi obodo Imo steeti. Ndị agha emepela ụfọdụ ebe ha mechichara n'obodo ahụ nke mere ka ndị mmadụ nweike na-akpagharị. Mana otu onye gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ụlọakụ ekweghị emepere ndị mmadụ ụlọọrụ makana enyebeghị ha iwu ka ha mee nke a. Ụfọdụ ndị kwuru na ụjọ ji ha maka nsogbu nchekwa dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Ọ bụ mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owerri, Imo steeti gbafuo ka a wakporo ya n'abalị Sọnde. Francis Enobore bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ ụlọmkpọrọ na Naịjiria, na-akọwa na ọ bụ mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owerri, Imo steeti gbafuo ka a wakporo ya n'abalị Sọnde. Enobore kwuru na ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ ji ogbunigwe gbarie ma bata ya bụ ụlọmkpọrọ. N'ozi ahụ, o kwukwara na mmadụ 35 ekweghi eso ibe ha gbafuo. Ozi ahụ kwukwara na John Mrabure bụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ ụlọmkpọrọ enyela iwu ka a maa imi n'ala ma nyochaa etu mkpamkpa a si mee. Uweojii sị na ọ bụ Ipob mere mwakpo a mana Ipob sị na ọbụghị ha Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu ekwuola na nyocha ha mere gosiri na ọ bụ ndị otu na-achọ nwereonwe mba Biafra na Naịjirịa Bekee kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) wakporo ụlọmkpọrọ na isi ụlọọrụ ndi uweojii n'Owere, Isi obodo Imo steeti. Mana, akụkọ ụfọdụ ụlọntaakụkọ na-ede na-ekwu na Ipob agọọla na aka ha adịghị na mkpa mkpa. Onyeisi ndị uweojii gara n'ihu kwuo na ha ezipula ndị otu iji gbaa ndị nke nọ n'Imo aka n'ukwu. Ndị uweojii ga-esi ngalaba ndị nke Bekee kpọrọ ""Police Mobile Force"" (PMF) na ndị ""Police Tactical Squads"" nọ n'ụzọ ị ga Imo ugbua maka atụmatụ a. N'akwụkwọ ozi Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba binyere aka kwuru sị na ndi bịara wakpoo ulọ ọrụ ndị a awakaporo n'Owere ji egbe di iche iche na ogbunigwe were bịa. Ha sị na ndị a abaghị ebe egbe na-mgbọ ndị uweojii na-adị ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii chụlala ha. Ha sikwa na ndị ahụ hapụrụ otu ụgbọala ha dịka ha na-ala. Onyeisi ndị uweojii gakwara n'ihu kpọkuo ndi na-achi steeti dị iche iche ka ha kwuo okwu megede ihe a na-eme. Ha sịkwa ka ndị mmadu gbara uweojhii ama maka ihe na-eme n'obodo. N'okwu ọgụgọ Ipob, ụlọ ntaakụkọ Nation dere na ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful sị ""ka ndi ntaakụkọ na ndị gọọmentị Naijirịa kwụsị ibo Ipob ebubo banyere mwakpo a."" Ụlo ntaakụkọ ahu dere sị: ""Ipob sị; ""Ọ sị na ha ""amaghi ndị unknow gunmen bụ"", ma sịkwa na ha abụghị Ipob nke ha ji abụ ESN."" Ndị agha na-akwụsị ma na-enyocha ndị njem si Onicha aga Owerri kamgbe awakpochara ụlọ mkpọrọ dị ebe ahụ Ka nke a na-eme, ndị agha Naịjirịa na-akwụsị ma na-enyocha ndị na-eme njem site n'Onicha gawa Owerri kamgbe ndị omekome wakpochara ụlọ mkpọrọ dị n'imo steeti ma gbuo otu onye. Onye na-eme njem n'ụzọ si Ọnicha gawa Owerri gwara BBC nke a. Nwa amadi a setere foto ebe ndị agha ahụ na-agwa ndị mmadụ ka chilie aka ha elu dịka ha na-eme njem. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe na-eme n'Owerri: Ugo Ebujo bụ ọkaiwu nakwa dọkịta ahụike ekwuola na mwakpọ ndị o ji egbe ezu wakporo ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri bụkwa nnukwu nsogbu nyere ndị Igbo. O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere taa bụ ụbọchị April 5,2021. Ugo kwuru ka ndị aka ha dị na ya bụ mwakpo gbara ọgwụ ha nwụọ makana okwu a aghọwala ihe ọzọ. O kwuru na kama ndị Igbo ga na-egbu onwe ha na ọ dị mma ka e nwe atụmaatụ akpọrọ 'Restructuring'. Na soshal midia, ndị mmadụ tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara ya. Lee ihe ụfọdụ kwuru: Henry Shield kwuru na site na mwakpo ụlọmkpọrọ nakwa ụlọọrụ ndị uweojii mere n'Owerri, na ndị mmadụ ekwesịghị ịghọrị onwe ha na ha amaghị na agwọ nọ n'akịrịka na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ. @SledgeAma kwuru na ebe o si dị njọ bụ na ọ bụ ndị na-amaghị ihe ọbụla gbasara ihe na-aga ga-akwụ ụgwọ ihe na-agbasaghị ha. Otu onye nwụrụ mgbe ndị o ji egbe wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri Otu onye nwụrụ mgbe ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owere, isi obodo Imo steeti n'abalị fotere ụtụtụ Mọnde ụbọchị Aprelụ 5,2021. Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ozu onye ahụ nwụrụ anwụ mana o dochaghị anya onye ọ bụ. A na-eche na ọ bụ otu onye mkpọrọ a gbaturu dịka ha ji ọsọ na-agbapụ n'ụlọ mkpọrọ ahụ. Ndị ekperima ahụ wakpokwara ụlọ mkpọrọ dị nso n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma tọhapụ ọtụtụ ndị mkpọrọ nọ n'ime ya. O dochabeghị anya ihe merenụ kpọmkwem mana BBC ka na-agba mbọ ịchọpụta. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu azaghị ekwentị ya ugboro ugboro anyị kpọrọ ya. Ụgbọala a gbara ọkụ n'okirikiri ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri Ọnụ na-ekwukwara ndị ọrụ nchekwa ụlọ mkpọrọ n'Imo steeti bụ James Madugba kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi iji kọwaara ọhaneze ihe merenụ kpọmkwem. Mana ndị bi n'Owere, ọ kachasị ndị bi nso n'ebe ya bụ ihe mere gwara BBC na ụra agaghị ha n'anya n'abalị ụnyaahụ niile. Otu onye aha ya bụ Paul kwuru na ụda egbe ekweghị ha rahụ ụra n'abalị. Mgbe BBC garuru n'ogige ebe mkpamkpa a kpara, ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ ekweghị ka anyị see onyonyo ọbụla. Ha kwuru na ha ga-enweta ikike n'aka onyeisi ha tupu onye ọbụla esee foto. Naanị n'ote aka ka ndị ntaakụkọ nwere ike ịnọ sete onyonyo ọbụla. Ụgbọala a gbara ọkụ n'okirikiri ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri Ndị uweojii machikwara ụgbọala ịgafe n'okirikiri ahụ. BBC hụkwara opekatampe ụgbọala isii n'okirikiri ụlọ mkpọrọ ahụ Onye ntaakụkọ ọzọ gwakwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ ji ogbunigwe gbawa ya bụ ụlọ mkpọrọ ahụ. O kwuru na ha tọhapụrụ ihe ruru ndị mkpọrọ puku abụọ. Ụlọọrụ Channels kwuru na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu kwetere na ya bụ mwakpo mere mana ọ kọwabeghị n'uju etu ya bụ ihe si mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51116907,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51116907,Hope Uzodimma abụrụla Gọvanọ nke isii n'Imo steeti,Ugbua ka Hope Uzodimma bụrụ Gọvanọ nke Imo steeti.,"Content is not available End of Facebook post, 1 Rochas Okorocha, aka chịburu Imo steeti, Uche Nwosu, Ifeanyi Araraume na Adams Oshiomole socha ndị bịara ịṅụ iyi Gọvanọ Uzodimma ndị bịara. Ihedioha ji ihu ọchị fee ndị Imo aka Emeka Ihedioha, aka chịburu Imo Steeti arịọla ndị Imo ka ha kwadoro ọchịchị Hope Uzodinma. Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede Wenezde. O kwuru na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti tụrụ ya n'anya nke ukwuu. Ihedioha kwukwara na ya ekwenyeghi na mkpebi ahụ n'ihi na ọ bụghị ikpe kwụ ọtọ n'anya ya. Mana ka o sina dị, o kwuru na ya na osote ya bụ Gerald Irona ga erube isi na mkpebi ahụ. O kwuru sị: ""Arịrịọ m na-arịọ ụnụ (ndi Imo) bụ ka ụnụ kwadoo ọchịchị onye bịara ịnọchi m, dịka ụnụ si kwadoo m."" ""Ana m arịọ ndị nkwado anyị ka onye ọbụla dere jụụ ghara ime ihe ọbụla ga-ebute ọgbaaghara."" INEC enyela Uzodinma asambodo ọchịchị ya Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC enyela Hope Uzọdịmma asambodo dịka Gọvanọ Imo steeti. Nke a na-eme dịka a na-akwado idu Uzodimma n'iyiọrụ n'Owere, isi obodo Imo steeti na mgbede Wenezde. Ụlọikpe Kachasị nọrọ ụbọchị Tuzde nye mkpebi ghọrọ ọ gbara Igbo gharị dịka ha nyere Uzodima mmeri n'ikpe onye bụ gọvanọ Imo steeti na ntuliaka 2019 ma, nye iwu ka Ihediha hapụ ọkwa ahụ ozigbo. N'etiti ehihie Wenezde, igwe mmadụ kụnyere ndị nze na ọzọ, ndị ndọọndọrọ ọchịchị, otu ụmụnwaanyị gbakọrọ n'ama ""Hero Sqaure maka mmemme idu n'iyiọrụ, Uzodinma. Ndịagha zọọ iji dịka ndị ọgụ ma were egwu ha merụba ụbọchị. Ndị mmadụ ka na-ekwu okwu gbasara mwepụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa wepụrụ Emeka Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma dịka gọvanọ Imo steeti. Ebe ụfọdụ na-ekwu na ha aghọtaghị etu Uzodinma bụ onye gbaburu onye anọ mgbe a gụkọrọ vootu si bụrụ onye mbụ ugbua, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ amụma Fada Mbaka buru n'isi ya mezuru. Lee ihe ha kwuru: Ndị otu PDP kwuru ka ọ ha ha n'ọnụ Femi Fani-Kayode bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, kwuru na ihe a bụ ọgbara Igbo gharịị. Ndị Igbo agaghị arịọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa arịọ Ichie Nduka Eya bụ otu onye so na ndị agha Biafra ekwuola na ndị Igbo agaghị arịọ arịọ ka e nye ha ọchịchị Naịjirịa. Eya kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo nwere ụbọchị Wenezde iji cheta afọ iri ise agha Biafra bechara. O kwuru na ọkwa onyeisiala Naijiria n'afọ 2023 bụ ndị Igbo ka o ruru n'aka. Eya gakwara n'ihu rịọ ndị ntorobịa Igbo ka hapụ tigbuo zọgbuo ma were akọnuche n'okwu gbasara etu Biafra ga-esi nwere onwe ya. Nkwụsị agha Biafra Taa bụ ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020, mere ya afọ iri ise kpọmkwem agha Biafra na Naịjirịa biri. BBC Igbo nwere ọtụtụ akụkọ dị iche iche si n'ọnụ ndị o metụtara, ndị hụrụ nakwa ndị so lụọ agha a. Gụọ maka ya n'uju ebe a: Ndị gọọmentị Rọshịa agbaala arụkwaghị m Onyeisiala Rọzhịa bụ Vladmir Putin na Praịm Mịnịsta Dmitry Medvedev Ndị isi gọọmentị mba Rọshịa agbaala arụkwaghịm dịka onyeisiala Vladmir Putin na-atụ alo ịgbanwe akwụkwọ iwu mba ahụ. Praịm Minista Dmitry Medvedev kwuru na ihe ahụ Putin na-akwado ime ga-agbanwe ọnọdụ ọchịchị mba ahụ nke ukwu. Cheta na Putin emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala Rọshịa ugboro anọ. Dịka iwu obodo ahụ si dị, ọ gaghị enwe ike ịzọ ọchịchị ọzọ ma ọ nọchaa nke a. Ọchịchị ya nke ugbua ga-abịa n'isi njedebe n'afọ 2024. N'Amerịka Ụgbọelu na-awufu mmanụ ụgbọelu Ihe ruru mmadụ iri isii gụnyere ụmụakwụkwọ na-anata ọgwụgwọ maka mgbakasị akpụkpọ ahụ ha n'ụlọọgwụ dị n'obodo Cudahy dị na Los Angeles na mba Amerịka. Ihe butere nke a bụ otu ụgbọelu Delta Airlines wụsara mmanụ ụgbọelu ya n'elu ụlọakwụkwọ ahụ dịka ọ na-achọ ụzọ o si efetu n'ọdọụgbọelu LAX, ka injin ya nyewere nsosgbu. Serena Williams Serena Williams A na-atụ anya na Serena Williams ga-ebuli iko 'grand slam' nke iri abụọ na anọ ya mgbe asọmpi tenis 'Australian Open' ga-ebiri ọkụ. Asọmpi a ga-ebido n'abalị iri abụọ nke ọnwa Janụwarị ruo abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị. Lukaku Inter Milan ji paụnd nde 74 zụta Romelu Lukaku n'aka Manchester United n'afọ 2019 Ọ dịkwa ka Romelu Lukaku nọ n'ofe ugbua, dịka o nyerela Inter Milan goolu na-erughi otu nkeji ha na Cagliari zutere n'asọmpi Coppa Italia. Goolu abụọ o nyere iji mee ka Inter were ọkpụ anọ a satara otu merie, emeela ka ọ bụrụ nke iri na asatọ ọ na-enye n'ime egwuregwu iri abụọ na ise ọ na-agbara ha. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a gbasara etu agha Biafra si bido ga-amasị gị: O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme" afirika-45306149,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45306149,Ntuliaka LG nke Imo steeti bụ ezigbo asị -Ekechi,TEO Ekechi bụ otu n'ime ndị kpụrụ okwu n'ọnụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti agwaala onye ntaakụkọ BBC Igbo na ntuliaka okpuru ochichi Imo steeti nke bekee kpọrọ Local Governement Elections ga-eme n'Imo state taa abụghị ezigbo ntuliaka maka mpụ na aghụghọ emetọọla yabụ emume.,"Onweghị ndọrọndọrọ ga-eme n'Imo state Ekechi kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche n'ime Imo steeti esepuola aka na ya bụ ntuliaka maka na ha mara na sọọsọ ndị kwadoro gọvanọ Rochas Okorocha bụ ndị ga-enwe mmeri. Okenze anọchiela Madumere n'Imo Steeti - Osuji 2019 Election: Ndị a chọrọ ịnọchite anya ndị Imo steeti Oge BBC Igbo gwara onyeisi ngalaba a bụ Nwoha Amaechi na BBC ga-achọ ị nyocha ihe ga-eme na ntuliaka, o kwuru na ụlọọrọ ya chọrọ sọọsọ mmadụ iri abụọ nakwa na ha enweela ndị mmadụ ruru yabụ akara ọnụ. BBC Igbo ga-agba butere ụnụ akụkọ niile ga-eme na steeti a taa gbasara ntuliaka a. Akụkọ ga-amasị gị" media-46535909,https://www.bbc.com/igbo/media-46535909,Chris Kehinde Nwandu: Iwu m dara kpụgara m n'ụlọ mkpọrọ,Chris Kehinde Nwandu akọwala etu Cyber Crime Law nke ewepụtara n'afọ 2015 siri metụta ya.,"Ọ kwuru na ndị mmadụ amaghị maka iwu a nke mere na ọ bụ ọnya na-amakarị ndị ntaakụkọ. Nwandu kwuru na agbanyeghi na Naịjirịa nọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya, ekwesiri ịnyocha iwu a iji nyere ndị ntaakụkọ aka ịrụ ọrụ ha n'atụghị egwu." afirika-46916186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46916186,Imo Election Results: Ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru,Igbo juru n'Owere mgbe BBC Igbo mere nrụrịta ụka nke ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steetị mana ọ bụ ihe tụrụ ndị Imo n'anya na naani otu onye n'ime mmadụ anọ kwesre BBC Igbo nkwa na ha ga-abịa nrụrịta ụka ahụ bụ ihe bịara ya.,"ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC Ndị a tere ndị Imo ụnyị n'ihu bụ Emeka ihedioha PDP, Hope Uzodimma nke APC na Ifeanyi Ararume nke APGA. Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere sị na ọ bụ sọọsọ Ararume bụ onye gwara ya na ya nwereike ghara abịa maka na ya na-amalite achụm nta vootu ya. Ya bụ emume bidoro ka o ji ọkara gacha elekere abụọ n'ehihe. Na nrụrịtaụka ahu sọọsọ ya bịara, Uche Nwosu kwere nkwa na ya ga-akwụ pụkụ naira iri atọ dịka ụgwụ ọnwa opekatampe ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti hibe ya. Nwosu gakwara n'ihu kwuo na pati ya enweghi onye na-azọ onyeisiala ka o tinyere ọnụ n'okwu banyere nkwado o na-enye Onyeisiala Muhammau Buhari. Ihe ọzọ o kwuru bụ; ""O nweghị ihe ọ bụla nọ na 'manifesto' m agaghị eme."" Okwu asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru: Uche Nwosu si APC banye otu AA iji zọọ ọkwa gọvanọ n'Owere Imo steeti Nwosu kwupụtara ihe ọ ga-emere ndị steeti Imo ma o were ọkwa ọchịchị na ntụliaka a ga-eme n'ọnwa Maachị afọ 2019. Ngwa, lee ihe ndị ọ rụtụrụaka na nkeji na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49996786,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996786,Unicameral Legislature: Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?,Naịjirịa nwere ụlọomeiwu abụọ.,"Ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Nke ukwu bụ 'Senate' ebe nke nta bụ 'House of Representatives'. Enwere ndị mmadụ otu narị na itoolu n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta nwere ndị otu narị atọ na iri isii. Kayode Fayemi, Gọvanọ Ekiti Steeti Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-eme iwu na Naịjiria buru nnkwu ibu. Ha na-ekwu na ọ ga-adị mma ma a kụchapụ otu n'ime ụlọomeiwu ahụ. N'ụbọchị Wenezde, Gọvanọ Ekiti Steeti kwuru na ọ ga-aka mma ma e wepu ụlọomeiwu sineti kpam kpam. N'okwu ya, ""Ụlọomeiwu dị mkpa bụ 'House of Reps'"". Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Rochas Okorocha. Ọ gwara BBC na mkparịtaụka na ọ ga aka mma ma ọ bụrụ naanị otu sinetọ na-anọchi anya steeti ọbụla kama atọ. Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ Chidi Lemchi, onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọchịchị gwara BBC Igbo na ya kwadoro ka e wepu ụlọomeiwu sineti. Lemchi kwuru na ndị ụlọomeiwu nta bụ ndị kacha mkpa n'ihi na ha na-anọchite anya ndị kacha nta n'okpuru ọchịchị niile. Mana o kwukwara na ego a na-akwụ ndị omeiwu kwesịrị ịgbadata. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Otu ụlọomeiwu a ga-aka mma? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya" afirika-44531446,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44531446,Akụkọ kachasị na-ụtụtụ a: ụmụ Naịjirịa juru nga n'Itali,Ụmụ Naịjirịa 1500 nọ na nga I tali,"ndị Naịjirịa 11,264 bi na Ịtali Onye nnọchite anya mba Itali na Naịjirịa bụ Stefanou Pontesilli, ekwuola n'ihe ruru mmadụ 1500 bụ ndị Naịjirịa nọ na mkpọrọ na mba ha. Stefanou Pontesilli gwara ndị nta akụkọ nke a ụnyaahụ n'Abuja. Ohaneze ndị Igbo ekwuola na nhazighị ọchịchị Naịjirịa bụ ma ihe adị mma Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo ekwusiele ike ọzọ na nhazigharị Naịjirịa bụ naanị ụzọ a ga-esị kwọọ ya bụ onye ukwu wara ka ije wee kwe ojịje. Nwodo kwuru nke a na Legos mgbe ha bịara ihibe ndị isi Ohaneze ndị Igbo n'ebe ahụ. Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ga-eke nkwụcha Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nwetere ikike ka ha kee nkwucha maka ndị omekome Gọọmenti Naịjirịa akpọkuola ndị ọrụ nchekwa ka ha kee nkwucha pụrụiche n'ọdọụgbọelu na ụzọ ndị ọzọ e sị abata obodo a. Oku a dị n'akwụkwọ ha degara ndị isi otu na-ahụ maka nchekwa njem ụgbọelu na Naịjirịa Ọkara nke iko mba ụwa Ịnglandị butere Iko Mbaụị̀a mbụ ha n'afọ 1966 N'egwuruegwu Iko Mbaụwa agbara ụnyaahụ Ịnglandị ji ọkpụ abụọ goolu abụọ asatara otu merie ndi Tunishia. Kane ndị Ịnglandị tinyechere goolu abụọ ahụ. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Gwa anyị ihe puru iche iji echeta nna gị?" afirika-44866099,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44866099,Akụkọ ndị dị mkpa: Mmadụ 20 ka na-efu na idemmiri Katsina steeti.,Akụkọ ndị dị mkpa:,"Mmadụ ruru iri anọ n'anọ anwụọla na Ide mmiri kworo n'obodo Jibia na Katsina steeti ma kwakpịa ụlọobibi ruru narị ise. Aka na-achị steeti ahụ bụ Aminu Masa gwara ndị ntaakụkọ na-aka na-achọ mmadụ iri abụọ dịka ndị na-efu efu. Ọzọ na Naịjirịa Ndị ọrụ Inec gosikwara njikere ha dị ibido ihe ha bịara Otu na-ahụ maka oke ruru mmadụ nakwa ezi ọchịchcị edegarala ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC akwụkwọ. Onyeisi otu a bụ Adetokunbo Mumuni gwara INEC ha nyochaa ebubo nrụrụaka mere na ntụliaka INEC nakwa kpee ndị ikpe mara ikpe iji chekwa ọchịchị onye kwuo uche ya. Na mba ofesi, Otu ụlọịkpe na mba Briten amaala Stephen Searle bụ onye Kounselọ ịkpe maka ọnwụ nwunye ya. Echere na Stephen tọgburu nwunye maka na ọ chọpụtara ma mmekọ dị n'etiti ya na nwaanyị ọzọ bụ nwụnye nwa ha nwoke. N'Egwuregwu, A na-anụ kepu kepu n'ọfọrọ obere ihe ka Ahmed Musa onye ọgba bọọlụ Naịjirịa tinye aka ị sonye otu egwuregwu Al Nassir nke Saudi Arabia, Ọbụrụ na ọ gaa ihu nke a ga-eme ya onye ọgba bọolụ Afịrịka akachasị akwụ ụgwo. Gee nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu" afirika-47631800,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47631800,Childbirth: Lee obodo anaghị ekwe nwaanyị dị ime mụọ nwa,"N'obodo Mafi Dove dị na mba Ghana, anaghị ekwe ụmụnwaanyị dị ime mụọ nwa n'obodo ha.","Ha na-ahụta ya na ọ ga-emegide 'chi' ha. Nke a mere ka ụmụnwaanyị dị ime na-eme njem tere aka, gawa obodo ọzọ ịmụ nwa ma ime mewe ha. Mana ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwulite okwu na-asị ka a kachapụ omume a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46657935,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46657935,APC: Fayose a na-akwa ha emo maka ihe Oshiomhole kwuru n'Imo?,Akụkọ dị mkpa: Fayose a na-akwa APC emo?,"Aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose, etinyela ọnụ n'okwu Adams Oshiomhole bụ onyeisioche otu APC, kwuru maka onye Onyeisiala Buhari na-akwado na ntuliaka Imo steeti. Fayose kwuru sị ""mgbe onyeisioche pati kwuru na onyeisioche ndị gọvanọ nọ n'okpuru pati ya achịtaghị aja, ekwesịghị ịgwa gị na pati ahụ nakwa gọọmentị ya adaala. Achịtaghị aja n'imo pụtara achịtaghị aja n'Abụja"". End of Twitter post, 1 EFCC asaala Union Bank N'agbanyeghi ihe ụlọakụ Union Bank sara na Twitter ebe ha kwuru na ọ tụrụ ha n'anya na EFCC wepụtara okwu gbasara ego a hụrụ n'ọdọụgbọelu n'Enugwu tupu ha emecha chọpụta, EFCC kwuru na ha ka ga-eme nyocha ọfụma iji mata nke bụ eziokwu. EFCC gwara BBC na ha ka ji ndị ha nwụchiri maka ego ahụ ruru nde abụọ na puku asatọ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Anyị ka ji ndị anyị natara nde $2.8 n'Enugu - EFCC Na mba ofesi, Awil Dihar Salad so n'ime ndị ntaakụkọ a na-anụ aha ha na mba Somalịa, so na ndị nwụrụ ka ogbunigwe e tinyere n'ụgbọala dị nso ebe onyeisiala mba ahụ bi n'obodo Mogadishu, gbapụrụ. Ihe ruru mmadụ iri na asaa merụkwara ahụ na mwakpo a nke ndị oyiegwu Al-Shabab kwenyere na aka ha dị na ya. N'egwuregwu, Arsenal agbarala isi onwe ha site n'ígba Burnley ọkpụ atọ asatara otu na Premier League n'izu a. Cheta na onye ọbụla kpụ ha n'ọnụ ka Southampton na Liverpool nyeruchara ha goolu atọ atọ oge ha zutere n'izu gara aga. Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela mmadụ atọ ha sị na-eyi uwe ndịagha were atọrị mmadụ Ndị ngalaba Federal Special Anti-Robbery Squad (F-SARS) sị na ndị a tọrọ di na nwunyee si Amerịka lọta maka emume ekeresimesi. Dasuki Galadanchi bụ onyeisi ndi uweoji n'Imo sị na ndị a nọ na-akwọrị dọla ha natala ndị a ha tọrọ mgbe aka ndị uweojii kpara ha. Buhari kwụ Uzodinma n'azụ -Oshiomhole Onyeisi oche All Progressives Congress (APC) Adams Oshiomhole ekwuola na ọ bụ Hope Uzodinma ka Onyeisiala Muhammadu Buhari na-akwado na ndọrọndọro oche gọvano n'Imo. Oshiomhole kwuru nke a ka ọ nọ ebe a na-eme emume mmalite achụmta vootu APC n'Owere. Cheta na Oshiomhole na Okorocha bidoro ịtụ onwe ha okwu kemgbe emechara ntulịaka imeụlọ nke APC n'Imo, bụ nke ọgọ Okorocha bụ Uche Nwosu so n'ime ndị atunyere vootu. Ụlọ gọọmentị n'Amerịka agbachiela Statue Liberty so na ebe mechiri, mana onye na achị New York na akọwa na ya ga eji ego steeti ya kụọ ndị mmadụ ụgwọ onwa Ụlọ ọrụ gọọmentị dị iche iche na mba Amerịka agbachiela ka Onyeisiala Donlad Trump na ndị Omeiwu enweteghị nkwekọrịta maka ego mgbidi ọ chọrọ ka agba n'oke Amerịka na mba Mexico. Nke a bu ugboro atọ ụlọ ọrụ gọọmenti gbachiri n'Amerịka n'afọ a. Nke a na-abịa ka ụlọikpe nke ukwu n'Amerịka kagbụrụ mmachị Trump tinyere igbochi ndị gbatara ọsọ ndụ itinye akwụkwọ ga-enyere ha aka nwete ikike ịnọ n'Amerịka. N'egwuregwu Mohamed Salah nyerela Liverpool goolu 44 n'afọ 2017/2018 Mohammed Salah dị ọkụ n'asọmpị nke Liverpool na Wolves gbara ụnyaahụ ka onyere goolu otu ma nyekwa aka nwete ọzọ ka ha ji okpụ gọọlụ abụọ asataghi merie. Anya ga-adị na Alex Iwobi ka Arsenal na Burnley ga-ezute n'ime otu asọmpị a ga-agba taa. Gee nkeji ndi ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Ọ ga-ekwe gị mee, kwuo ihe bụ 'Flag' n'Igbo Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-46930647,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46930647,Nigeria 2019 Elections: Ị ma aha pati 91 dị na Naịjirịa?,Ịma na otu pati nọ na Naịjirịa dị 91?,Pịa akara ka ịmara aha ole n'ime ha inwere ike nwete na nkeji atọ. egwuregwu-47973037,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47973037,Aka m Atiku gụọ akwụkwọ- Buhari,Onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Goddie Uwazuruike ekwuola n'okwu gbasara aka onyeisiala Muhammadu Buhari na-ama Atiku n'ebe agụmakwụkwọ ha abụọ dị bụ akụkọ ajembele iji wepụ anya n'okwu dị mkpa gbasara ka ntuliaka 2019 siri gaa.,"Aka m Atiku gụọ akwụkwọ- Buhari Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019 Onyeisiala Muhammadu Buhari mara Atiku Abubakar nke PDP aka n'ihu sị ka o wepụta asambodo akwụkwọ ndị ọ sị na ọ gụrụ dịka ọ na-ekwu na ya bụ Buhari ka Atiku n'ịgụakwụkwọ nakwa ịma nke ụbọchị na-akọ. Nke a na-eme dịka PDP na Atiku gbara Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu ka a kagbuo mmeri Buhari na ntuliaka 2019 ma na-ekwu na Buhari enweghị asambodo sekọndrị dịka o siri tinye n'akwụkwọ. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ekwenti, Uwazuruike kwuru na ,"" Ọ bụ ịgba egbe ọnụ"" ka Buhari na-agba iji wepụ ndị mmadụ anya n'okwu dị mkpa a kpụ n'ọnụ. ""Atiku abịala kwuo na ọ bụ meriri na ntuliaka 2019, Ihe onye na-achị achị kwesịrị ikwu bụ 'mba, ọ bụ mụnwa bụ Buhari meriri.' ị gosikwa etu isi merie. Uwazuruike onye bụ bu onyeisi Aka Ikenga gara n'ihu sị, ""Mana ị bịa na-akọ ihe ndị ọzọ enwnweghị isi, ọ bụ ịmarụ ọnụ. Ekwuo elu kwuo ala, ihe anyị chọrọ ịma bụ onye meriri na ntuliaka 2019."" Nke a bụ isiokwu ikpe a, ya ka ndị mmadụ na-atụanya. Otu tanka bu mmanụ agbịdị tiwara gbaa ọkụ n'okporoụzọ Lagos n'Ibadan n'ehihie ụbọchị Tọzde. Mmadụ abụọ regburu n'ime ọkụ a Akụkọ na-ekwu na ndụ mmadụ abụọ efuola ha maka ọkụ a. A na-eche na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na ya bụ ọdachị mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ya. Ụgbọ ndị ọkụ a metụtara n'okporoụzọ Legọs na Ibadan Ndị mmadụ nọ ebe ihe mere kọwara na o teela aka ọkụ a na-agba tupu enyemaka erute ha nso. Ụgwọ opekatampe. Onyeisiala Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-eme ka ndị ọrụ Naịjirịa bido ịnata puku naira iri atọ dịka ụgwọ opekatampe. A na-atụ anya na ụgwọ ọhụrụ a ga-ebido ozugbo ozugbo n'ime ihe dịka ọnwa Mee. Cheta na otu dị icheiche na-agbagha ego ole ụgwọ opekatampe ga-abụ tupu e kweta na puku naira iri atọ. Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki tinyere ọnụ n'okwu a site n'akara Twitter ya. N'egwuregwu Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ Erela ihe karịrị ọkara na tiketi niile e dobere maka asọmpị iko mba ụwa ụmụnwaanyị ga-eme n'afọ 2019 a. BBC ghọtara na asọmpị dị n'etiti Nigeria na Fransị so na ndị erechara ere. Ị ka na-eche gịnị? Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Assest Declaration : Onnoghen ga-ama ebe ọ kwụ taa: Onye bụbu ọkaikpe ukwu Naijiria bụ Walter Onnoghen ga-amata ebe ọ kwụ taa dịka a ga-ekpebi ikpe gbasara akụnaụba ya a sị na ọ depụtachaghị ka ọ ha taa bụ Tọzde. ______________________________________________________________________________________________________________________________________ Malabu: Ụlọikpe enyela iwu ka a nwuchie Adoke,Etete na ndị ọzọ Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja enyela EFCC ikike inwụchi onye bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka ikpe bụ Mohammed Adoke, na onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Dan Etete maka aka n' ebubo gbasara ebubo nrụrụaka so nkwekọrịta orire mmanụ Malabu. Ndị ọzọ o kwukwara ka a nwụchie gụnyere Raph Wetzels, Casula Roberto, Pujato Stefeno, nakwa Burrato Sebastiano. Ndị a niile bụ ndị a na-ebo ebubo n'aka ha dị na okwu nruru aka ahụ kwesịị ịbịa ụlọikpe ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Eprelụ mana ahụghị ụkwụ ha n'ụlọikpe. ______________________________________________________________________________________________________________________________________ Iwu asaa Buhari jụrụ ajụ mana Sineti binyere aka Ụlọoomeiwu ukwu ebinyela aka n'iwu ga-eme ka a tụọ onye nkịtị ọbụla yi uwe ndị uweojii were ga ntọ mkpọrọ afọ ise mana iwu ahụ ekwughị ihe a ga-eme onye uweojii ji ike ekwesịghị ekwesị merụọ onye nkịtị ahụ maọbụ bute ọnwụ ya. Nke yiri ibe ya, ndị ụlọomeiwu ukwu binyere aka ma wepụta iwu asaa nke Ọnyeisiala Buhari jụburu ibinye aka na ya n'ihi ihe ọ kpọọ ikerịta ọrụ dị na ngalaba gọmentị dị iche iche. I wu ndị agụ gụnyere Iwu gbasara nchekwa mmanụ dị n'ala(PIGB), Iwu ịhazigharị ụgwọ a na-akwụ maka stampụ.(stamp duties), Iwu hiwere agụmagụ banyere njem nleta(National Institute of Hospitalism and Tourism) nakwa nke Kaụncul ga-naahụ maka nchọpụta(National Research and Innovation Council). Iwu ndị ọzọ gụnyere nke ime ka ụlọfrrụ Inec kwụrụ onwe ya( Independent National Electoral Commission (INEC) Act 2010 (Amendment),ngalaba maka nchekwa mkpụrụ a na-akọnye n'ala( National Agricultural Seeds Council Bill) nakwa ngalaba mgbazinnye ego maka ọrụugbo ( Agricultural Credit Guarantee Scheme Fund) ______________________________________________________________________________________________________________________________________ Facebook adajọọla ọzọ Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa Ụlọọrụ Facebook gbara ama na ha gbara akara igbe ozi ihe karịrị otu ndị̄ mmadụ n'ọ n'igwe okwu ha kemgbe afọ 2016 n'anwụ na amaghị ama. Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ịkagbu ozi ndị a ha gbara n'anwụ na anataghị ikike ndị nwe ya. ______________________________________________________________________________________________________________________________________ N'egwuregwu U-17 World Cup qualifier:Niajiria kụgburu Angola Nigeria players and team members carry head coach Emmanuel Amuneke after winning the Under-17s World Cup Otu Golden Eaglet abụrụla otu egwu bọọlụ mbu na Africa nwetara ọnọdụ na asompi mbaụwa nke ndị akarịbeghị afọ iri na asaa dịka ha ji otu ọkpụ asataghị ihe were merie ndị Angola na asompi ha gbara Dar es Salaam ụbọchị Wenezde. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-51798517,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51798517,Emir of Kano: Nchutu Sanusi wụrụ m akpata oyi - Moghalu,Kingsley Moghalu bụ onye ji aha pati UPP zọọ ọkwa onyeisiala etinyela ọnụ n'ọchụchụ Sanusi dịka Emir nke Kano.,"N'ozi o wepụtara n'akara twitter, Moghalu sị na ọchụchụ Sanusi bụ ihe akpata oyi nye ya, ma bụrụkwa ihe mgbawa obi. End of Twitter post, 1 Cheta na Kingsley Moghalu na Sanusi rụkọrọ ọrụ n'ụlọakụ etiti mgbe Sanusi bụ onyeisi ha, ọ họpụtara Moghalu dịka otu n'ime ndị osote ya. Nke a mere Moghalu ji akwanyere Sanusi ugwu dịka nna ya ukwu n'ihe banyere akụnaụba. Sanusi kwadoro Moghalu mgbe ọ na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019. Aminu Ado Bayero abụrụla Emir nke Kano ọhụrụ Gọọmentị Kano Steeti ahọpụtala Aminu Ado Bayero Emir ka ọ bụrụ nke Kano ọhụrụ. Odeakwụkwọ Steeti ahụ bụ Alhaji Usman Alhaji kwụpụtara nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu. Tupu ugbua Aminu Ado bụ Emir nke Bichi nke gọvanọ Ganduje kewapụtara ọhụrụ. Aminu Ado Bayero bụ nwa Emir Ado ga-abụzi Emir nke iri na ise ga-achị obieze Kano nke Fulani. O jiela ọkwa dị iche iche n'ọchịchị Kano dịka 'Kano Trucks', Eze ndị 'Sacred Heart' nakwa 'Kano River'. Ọ bụ nwa nwoke nke abụọ kachasị okenye n'ezinaụlọ Eze Ado Bayero nwụrụ anwụ. Etu esi chụpụ Sanusi n'obi ọchịchị Kano Ndị ọrụ nchekwa na Kano achụpụla Eze Sanusi site n'obi ọchịchị dị na Kano n'ime awa ole na ole gọọmenti kwụsịrị ya ọrụ n'ike. Kọmishịona mgbasaozi na Kano steeti bụ Muhammad Garba gwara BBC na onweghi ihe mere Emir Sanusi. ""A ga-akpọga ya n'ụlọ nwere nchekwa ebe ọ ga-ebi,"" Muhammad Garba kwuru. Mana akụkọ kwuburu na a gbara anwụrụa anya mmiri n'obi ọchịchị. BBC dere akụkọ na ndị ọrụ nchekwa gara ebe ahụ mgbe ụmụnwaanyị gbakọrọ mana ha malitere ịtụ ndị nchekwa okwute. Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia @cchukudebelu kwuru na ọ bụ ugbua ka Sanusi ga-abụzị onyeisiala Naịjịrịa. @Abizarridanmusa kwuru na ihe a mere Sanusi nwereike ịbụ Ngọzi nye ụmụ Naịjirịa. @Omojuwa na-ekwu na Sanusi agbanyeghị na ewepụla ya n'oche eze Kano, ọ ka dị ụmụ Naịjiria mkpa. Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir Gọọmenti Kano ekwuola na ọ bụ ha wepuru Emir nke Kano bụ Muhammadu Sanusi n'ọkwa ọchịchị Emir ya. N'ozi odeakwụkwọ steeti Kano bụ Alhaji Usman Alhaji wepụtara kọwara ihe mere ha ji, na ọ bụ ndịisi ọchịchị kwekọrịtara iwepu Sanusi n'ọkwa. Ha sị na Sanusi anaghị akwanyere ọchịchị gọvanọ Kano steeti ugwu ruru ya. Na ọ naghị aza oku gọọmenti Kano kpọrọ ya, nke nwereike imebi ọchịchị Kano. Mana onye ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Kabiru Safi Sufi sị gwara BBC na ọ bụ maka etu Sanusi ji akatọ ọchịchị gọvanọ Kano bụ Abdullahi Umar Ganduje. Onye bụ Eze Muhammad Sanusi nke abụọ? Emir ndị Kano Muhammadu Sanusi nke abụọ ASUU agbaala abụbụọrụ izuụka abụọ Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ ASUU n'ịchafụ amalitela abụbụọrụ izuụka abụọ taa. Onyeisi ha bụ Biodun Ogunyemi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchị Mọnde dịka ha mechara nzukọ ndịisi otu ahụ n'Enugwu Ọ sị na nke a bụ iji dọọ gọọmentị aka na ntị ka ha leba anya ma mezuo nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 ruo 2019' Abụbụọrụ a ga-anọ izuụka abụọ malite n'ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2020. Ihe ise ọhụru Ụkọchukwu David Oydepo kwuru maka ọchịchị Buhari David Oyedepo bụ ụkọchukwu Winners Chapel esuwala akụ oyibo nsugbe maka ọchịchị nọ ugbua na Naịjirịa. O kwuru na ihe kacha njọ merela Naịjirịa bụ ọchịchị nọ ugbua. Oyedepo kwuru okwu a n'ọgbakọ ụka sọnde nke Maachi asatọ nke afọ 2020 n'ụlọ ụka ya. Lekwa ihe anọ ndị ọzọ o kwuru Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia maka okwu ya @the_davidatta kwuru ka Oyedepo kwụsị ikwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị ma gbado ụkwụ n'igbasa oziọma. @Iamroyaltea1 kwuru na o nweghị ihe dị njọ na mmadụ kwuru uche ya gbasara okwu na-emetụta ya. Minista na-ahụ maka Ahụike bụ Osagie Emmanuel Ehanire ekwuola na onye ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa. Dịka ngalaba na-ahụ maka ọrịa ịgbasa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) si na onye so n'ime ndị zutere onye bụ nje bata Naịjirịa na steeti Ogun. NCDC na-akọwa na onye nọbụ n'ebe akpọsara ndị eche na ha nwere nje a. Ha sị na ndi niile zutere nwoke ahụ bubatara nje Naịjirịa ga-anọ ebe ahụ akpọsara ha, dịka a na-eme nyocha ndi nke emebeghi. Coronavirus na mba Afrịka ndị ọzọ Ndị ọrụ ahụike na mba Ijipt Otu nwoke onye Germany abụrụla onye mbụ lara mmụọ n'ihi ọrịa coronavirus na mpaghara Afrịka. Nwoke a gbara afọ iri isi nwụrụ na mba Ijipt n'ụbọchị Monde a. Ndị ọrụ ahụike mba Ijipt kwuru na nwoke ahụ ekweghi ka edopu ya iche ka ọ ghara ibufe ndị ọzọ ya bụ ọrịa. O ruola mmadụ 48 bu ọrịa coronavirus na Ijipt, nke a gụnyere mmadụ 45 na-eme njem nlere anya n'ime ụgbọ mmiri nke batara mba ahụ n'ụbọchị Satọde. Ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa coronavirus na Afrịca Na mba Amerịka Ndị ọchịchị steeti Washington DC nke mba Amerịka arịọla ndị ụka a kpọrọ Christ Church ka ha kwụsị mmekọrịta ha na ndị mmadụ ruo abalị iri na anọ iji gbochie mgbasa ọrịa coronavirus. Nke a na-abịa dịka achọpụtara na ụkọchukwu ụlọụka ahụ bụ onye mbụ butere ya bụ ọrịa na steeti ahụ. Akụkọ kwuru na ụkọchukwu ahụ nyere ọtụtụ mmadụ oririnsọ ma kwekwa ha n'aka n'izuụka gara aga tupu e mechaa chọpụta na o nwere ọrịa coronavirus. Boko Haram awakpola ọnọdụ ndị agha na mba Niger Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ Ndị otu ọlụọ ọlaa akpọrọ Boko Haram awakporo ọnọdụ ndị agha na mba Nije ụbọchị Satọde. Ndị agha meruru ahụ maka ya bụ mwakpọ na-anata ọgwụgwụ n'ụlọọgwụ dị na Diffa dịka ndị ọrụ ntaakụkọ AFP kwuru. Ya bụ akụkọ kwuru na ndị ajọ otu bụ ọtutụ ụgbọlal ji ngwaagha dị egwu were bata ọnọdụ ndị agha nke Chetima Wango. O nweghị ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo. Mmanụ agbidi adaala Ọnụ ahịa mmanụ agbidi ejirila pasent iri atọ maa afọ n'ala taa bụ Monde dịka Saụdị Arabịa na-akụtụ ọnụ ahịa mmanụ ma na-ebuputakwa mmanụ ka na-anwụ anwụ. Nke a atọghị ọchị maka na ndị ọkachamara n'ahịa mmanụ na-atụegwu na ọ ka nwekwere ike ịdakwu. Coronavirus na amụbanwanye n'Ịtali Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan N'ofesi, ọnụọgụ ndị bụ Coronavirus na Ịtalị ewerela pasent iri abụọ na ise ria elu. Nke a na-eme dịka mba ahụ gbochiri ọpụpụ na mbata obodo Lombardy nakwa ebe ndị ọzọ ya bụ ọrịa na-agbasa. Leicester City na Aston Villa Ndidi Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi Ụmụigbo Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi ga-eso n'egwu oge otu bọọlụ ha bụ Leicester City ga-ezute Aston Villa na abalị Monde. Leicester na-agbalị ịnọsị ike dịka ndị nke atọ na tebulu English Premier League. Real Madrid na Real Betis N'ewguregwu, Real Betis ewerela ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Real Madrid n'asọmpị La Liga agbara na Spain Ụnyahụ. Mmeri a mere ka Real madrid bụbu ndị mbụ n'okpokoro ligi ha daa azụ. Chetkwa na Coronavirus ka nọkwa, gaa na BBC Igbo mata ka ị ga-esi chekwaa onwe gị. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44017196,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44017196,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: ọgbaaghara dị na Delta steeti ugbua,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,"Otu nwoke anwụọla na Delta steeti ebe a na-eme nzụkọ otu ndọrọndọrọ APC. Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na a sụ gburu Jeremiah Ojeveta so na ndị na-azọ ọkwa chairman n'agba Ughelli ka nzụkọ ahụ na-aga niru. Na APC ọzọ Ntuliaka jisiike na-aga n'ọgbakọ APC nke Ekiti maka ị ma onye ga-anọchi anya ha ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ n'abịa n'ọnwa Julai. End of Twitter post, 1 Oke mmiri ozuzo meburu ka ọ ga-akwasa ntuliaka a. Na mba Ofesi Agbaala otu nwata nwaanyị dị afọ iri n'isii ọkụ ebe awakpochara ya na India. Ụmụ nwoke abụọ a tụrụ aka na ha wakporo ya mere nke a maka iwe ihe nne na nna nwata nwaanyị ahụ jiri gwa ndị isi na ọ bụ ha wakporo nwa ha. Egwuregwu Otu bọọlụ Stoke city apụọla na asọmpị Premier League. Nke a mere ebe otu Crystal Palace meriri ha n'asọmpị ha gbara taa. Cheta na Stoke City nọrọ na Premier League ihe ruru afọ iri kemgbe 2008. Gee akụkọ kachasị mkpa na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" egwuregwu-48774555,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48774555,Nigeria Vs Guinea: Ugo amaburula enyi Guinea tụọ n'ala,"Dịka Naijiria na Guinea na-ezute onwe ha ugbua, ọ bụrụ na Naijirịa merie, ha etozuo ịbanye agba nke 16 n'asompị Afcon.","Asọmpi a bụ ọgụ na mgba dị n'etiti dike abụọ, enweghi onye nyere ibe ya goolu n'ime ọkara mbụ ha gbara. Mana Naịjirịa ji bọọlụ n'ụkwụ karịa ndị Guinea dịka otu abụọ gbara shọọtụ anọ nakwa atọ chere la ihu na neetị. N'ime nkeji iri 27, 62 na 66 Simon Falette, Ahmed Musa na Ernest Seka nwetere akwụkwọ odo odo nke eji dọọ ha aka na ntị. N'ime nkeji 73, Kenneth Omeruo ji isi sụba gọọlu n'opio ndị Guinea site na bọọlụ elu Moses Simon gbaara ya." egwuregwu-53466442,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53466442,"Thelma Chiaka: 'Dọkịta kwuru na ụmụ anọ dị n'afọ m, mana isii ka m mụpụtara'","Ifeoma Thelma Chiaka na di ya Onyemaechi chọrọ ụmụ ka ha mechara agbamakwụkwọ ha. Ka afọ ise gachara, ọ tụrụ ime site n'enyemaka IVF.","Mgbe ọ gara nyocha afọ ime ya, Thelma chọpụtara na ọ dị ime ejima anọ. Mgbe ọzọ ọ gara, ọ hụ na ọ bụzị ejima ise. Ka ọ na-amụ pụta ụmụ ya, ejima isii ka ọ mụpụtara. Na mkparịtaụka anyị na ha nwere, Ifeoma na Onyemaechi kọwara ije ha gara ịmụta ụmụ ha na ọnọdụ ha ugbua dị ka nne na nna. Ndị mere ya: Chioma Nkemdilim, Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru" afirika-51631350,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51631350,Ọgba mbọ: 'E ji m asambodo mahadum mana a na ma-azụ ezi',"A na-asị na ọ bụrụ na ịchọtaghị ọrụ, ịchepụta ọrụ.","Nke a bụ ihe mere Chidi, nwaokorọbịa na-azụ ezi. Ọ gwara anyị na ọ bụrụgodi na ọrụ bia ugbua ọ gaghị elenwuzi ya anya maka ezigbo ego ọ na-enweta n'ịzụ ezi. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50963438,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50963438,2020 New Year: I nwere mkpebi maka afọ ọhụrụ a? Lee ụzọ ise ị ga-esi mezuo ya,"Afọ 2020 amalitela, anyị anabatala afọ ọhụrụ.","Ọtụtụ n'ime anyị na-ahụ oge a dịka mgbe ha ji eme mkpebi ime ihe ga-abara ha uru. O nwereike ịbụ ichuso ezigbo ahụike, ihazi ego gị, imụta aka ọrụ ọhụrụ maọbụ ịkwụsị ụfọdụ agwa kpam kpam. Otu ihe kacha dị ezigbo mkpa na mkpebi ọbụla i mere bụ nkwalite mmụọ mana mụ na gị ma na ọ naghị adịcha fecha fecha. Atụmatụ a na-atụpụtaghị ọfụma nwereike ịda mba Naanị mmadụ ruru pasentị asatọ na-emezu nkwa ha kwere onwe ha n'afọ ọhụrụ dịka otu nchọpụta e mere na Mahadum Scanton nke Statistic Brain wepụtara. O kwesịghị ịbụ gị. Lee ụzọ ise ị ga-esi gbanahụ akwụdoghị na mkpebi i mere n'afọ ọhụrụ. Ya gaziere gị! 1. Bido obere obere Bido n'ikpebi obere ihe ị ga-emeli. I bido na nke nke, ị nwereike igbago n'ogo dị elu. Ụfọdụ na-eche na a ga-eji 'abracadabra' wee nwete ihe ha na-achọ dịka Rachel Weinstein bụ ọkammụta n'ihe gbasara etu mmadụ si akpa agwa si depụta. Iji maa atụ, malitegodu na-agba ọsọ ọha a kpọrọ 'marathon' site n'igorogodu akpụkpọụkwụ ị ga-eji na-agbachara ọsọ n'ime ụlọ gị. Ị chọrọ ịbụ ọkachamara n'isi nri, ọ ga-adị mma isoro onye ma anya ya ọfụma na-emechara ya tupu i nwee ike ịkwụdo ọfụma. Makana n'ezie n'ezie mgbanwe na-abịa na nke nke dịka Weinstein si kwuo. 2.Kpọọ okwu aha Anyị na-enwekarị ihe anyị chọrọ ime n'obi mana anyị enweghị eserese etu anyị ga-esi mezu ya. Ọ dịmkpa ime nke a. Iji maa atụ, kama isi m ga-anagakarị ụlọ mgbati ahụ n'afọ, ọ ga-adị mma ka ikwu ụbọchị ndị ị ga-anaga ya bụ ebe n'ime izụ ụka. Nke a ga-eme ka mkpebi gị bụrụ ihe mmezu kama ị bụ naanị ihe okwu ọnụ dịka ọkammụta Neil Levy nke mahadum Oxford si depụta. 3. Chọọ ndị gị na ha ga-ejikọ aka Ịchọta ndị gị na ha ga-agakọ njem imezu ebum no obi gị gbasara afọ ọhụrụ a na-agbakwa ume. Nke a gunyere na ịchọta ọyị gị, gị na ya ga na-agakọ ọmụmụ gbasara ihe ahụ ịchọrọ ịmụta maọbụ ikwupute mkpebi gị ka ọha nụrụ ya. Dr John Michael na-akuzi na mahadum Warwick ekwuola na inweta nkwado n'aka ndị ọzọ ga-enye aka ime ka ịnweta ihe na-achọ ọsịsọ. 4. Merie Ikpụ afọ n'ala Ihe sie ike, gba nkiti ma nyochakwa ọnọdụ ọzọ ọfụma. Kedụ ihe mgbochi ị gabigara?Kedụ ụzọ kacha dịmma is igboo ya?Kedụ nke na-adabaghị. Gwa onwe gị eziokwu ma ṅụrịa ma onwe nke ịmetere ọfụma. Iji ma atụ, ọ bụrụ na ịxchọrọ ị na-eri ezigbo nri , kama iri achịcha ọcha, rie nri esi n'Oka wee mepụta. I nwekwara ike hapụ iri ihe ntacharị ọnụ na-ebute ibu ma na-eri ihe ntacharị ọnụ eji mkpuru osi na-edozi ahụ. 5.Kwe ka mkpebi gị na ihe ga-eme n'ọdịnihu Mkpebi kachasịnụ bụ nke ya ị na ebum n'obi gị n'ọdịnihu na-agakọ karịa ma ina-etigharị dịka ọkammụta na agwa mmadụ bụ Dr Anne Swinbourne si kwu. Ọ bụrụ na igosi beghị mmasị gbasara egwuregwu, ọ baghị uru ịrọwa nrọ ị bụ ọkaibe na ya. Naanị mkpebi siri ike ezughị ime ka o mezuo, ị ga-eji eserese ị ga-eji me ka ọ bịa na mmezu. Ụjọ atụkwalagị ị nweta nkwado maọbụrụ na ọhịawara gị ahụ imezu nkwa ịkwere onwe gị n'afọ ọhụrụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị Lee emume mgba ndị Imerienwe" afirika-43014411,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43014411,Innoson: Enyeghị m akwụkwọ bia ụlọikpe,"Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere n'ekwentị, ọnụ n'ekwuchitere Innoson Motors bụ Cornel Osigwe kwuru sị, ""Innoson bụ ojiegoachụego a ma ama. Ọ naghị atụ egwu ịza ụlọikpe oku. Ọ bụ na asịrị ka ndị ọkaiwu ya nụrụ ya bụ oku were si ka ha ga mara ma ọ bụ eziokwu.""","Innocent Chukwuma Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie Chukwuma ma kpụta ya n'ụlọikpe ụbọchị anọ nke ọnwa Maach n'ihi na ọ baghị ụlọ ikpe ụbọchị e hiri ikpe ya. Ndị ọkaiwu Chukwuma rịọrọ ụlọikpe ka ha zigara Chukwuma akwụkwọ oku ahụ, ebe ọkaikpe nyere iwu ka enye ha ya n'ụlọikpe ozigbo. Ka ọ dị ugbua, Ndị ọkaikpe Innoson Chukwuma a gala ị hụ ịkpesara ụlọikpe nke Appeal ka ọ nyere ha aka mee ka e zitara Chukwuma akwụkwọ oku dịka iwu obodo siri kwụo. Cheta na ngalaba na-ahụ maka mpụ na mmerụaka akpọrọ EFCC na aha ịchafụ kpụpụrụ Innocent Chukwuma ụlọikpe maka ebubo iji aghụghọ nweta ihe, ohi na ime akwụkwọ adịgboroja nke e kwuru na o mere bido na afọ 2009 rue 2011. Mana Innoson na-ekwu na ụlọegọ GTBank nke ha na ụlọọrụ ya nwere esemokwu azụmahịa bụ aka enwe dị na ofe ahụ." afirika-44240739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44240739,NCDC: Anyị dị njikere maka Ebola,Ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka mgbochi ọrịa n'ala anyị bụ Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) na bekee ekwuola na Naijiria adịla njikere ịgbanahụ ịma n'ọnya Ebola dịka ndị Super eagles na-akwado izute mba Kongo n'asompi enyi na enyi.,"Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara Ọtụtụ ndị Naijiria na-atụ uche na o nwere ike ọrịa Ebola abata Naịjirịa ma ọ bụrụ na Naịjirịa na mba Kongo aga n'ihu mee asompi bọọlụ bọọlụ enyi na enyi ha na-akwadọ n'abalị 25 nke ọnwa Mee (echi). Dịka WHO si kwuo, ka o si kwụrụ na mba Kongo n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee afọ 2018, mmadụ iri ise na asatọ enwela njirimara ọrịa Ebola, ọtaala isi mmadụ iri abụọ na asaa( 27), ebe mmadụ iri abụọ na asatọ (28) bụ ndị doro anya bu ọrịa ọjọọ ahụ. O nweghị onye chọrọ ka ihe mere n'afọ 2014 oge Patrick Sawyer bubatara ajọ ọrịa na-efefe ma na-egbuli ọkara ndị nwetara ya bata ọzọ na Naịjirịa. Ebola na-agbasakwa ka ọkụ ụgụrụ site na mmetụkọ ahụ maọbụ ọbara, mmiri si n'ahụ mmadụ maọbụ anụmanụ ọ na-arịa maọbụ akwa(clothes), akwa(beddings) ha dinara. Agbanyeghị na Ebola bidoro n'ime obodo ebe a na-erikarị anụ agbatara na nta, ọ dị mfe ịgbasa n' obodo mepere emepe(cities) ebe e nwere ọtụtụ mmadụ nke butere ịtụ egwu. Mana na nkọwa ya, onyeisi NCDC bụ Dọkịta Chikwe Iheakweazu kwuru na Naijiria ejikela ajị n'ume igbochi Ebola n'asompi ahụ. O kwuru na NCDC na ndị isiọrụ ọdọụgbọelu, Mịnịstri etiti na-ahụ maka ahụike nakwa ndị isi otu na-ahụ maka bọọlụ bụ NFF ejikerela igbochie ọrịa ahụ isi na ndị ọbia ahụ bata Naijiria. Iheakweazu kwuru,""Ọnọdụ ọbịbịa ha dị iche n'ụzọ pụrụ iche; Anyị ma ndị na-abịa, anyị ma ebe ha ga-anọ. A ga-enyocha tupu ha abata. Okwu ọbịbịa ha bụ obere okwu."" Dkta Chikwe Ihekweazu: Ihekweazu kwukwara na e nwela atụmatụ nlebanye anya ga na-agụkọ ka ọrịa na- apụta na steeti ga ngwa ngwa ha nwetara ya, ebe ụlọọrụ nyochapụta ọrịa nke gọọmenti hiwere bụ National Reference Laboratory dị n' Abuja, a dịrịla njikere inyocha ọtụtụ ọrịa ndị metụtara ọha. Otu dọkita bụ ọkachamara n'ihe gbara ahụike ọha (public health physician)Dkta Lanre Makinde kwuru na ọ buru n'ezie na ha enwela ezi nkwado, na Naijiria nwere ike igbochinwu ebola isi asompi a bata. Mana ọ na-atụ uche na dịka anyị si eme na mbụ, Naijiria anaghị agba ọsọ mmiri ma o zughị ha ahụ. Makinde si: ""I cheta n'oge mbụ e nwere Ebola, gọọmenti gwara anyị na ha dị njikere, ma e mechaa Ebola bata. ""Ọ bụrụ na ọ bụghị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụ ihe ga-ekwe omume ma Naijiria kwadoro ọfụma."" kụkọ ga-amasị gị:" afirika-43166705,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43166705,Tinubu: Oyegun na-egbochi ọrụ ịkpa ụdọ Buhari nyere m,Tinubu bụ onye chịbụrụ Lagos n'oge gara aga kwuru na onyeisi pati APC bụ Oyegun na-emebi ọrụ onyeisiala Buhari keere ya ị chịkọta otu ha maka ịkwado ntuliaka afọ 2019.,"Tinubu ji ọrụ ị chịkọta otu patị APC tupu ebido ntuliaka nke afọ 2019 Ọ sị na mmụọ ya mere nkụda ebe Oyegun nọ maka na n'agbanyehị nzụkọ ha nwere maka ị dozi ime otu ha, Oyegun gara niru na-atụ ya aka n'anya. O kwuru ihe ndị a n'ime akwụkwọ ozi nke o degara ya bụ Oyegun ma gosi kwa Onyeisiala Buhari, osote ya Yemi Osinbajo, Onyeisi ụlọọrụ Sineti Bukola Saraki na Onyeisi ụlọọrụ omeiwu ukwu Yakubu Dogara. Ọtụtụ ndi mmadụ na-ekwu na ọrụ ekenyere Tinubu siri ike ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọbụ ịhe nkwụghachi Buhari nyere Tinubu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51749436,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51749436,"'Hope Uzodimma ga-ewetara ndị Imo ọrụ 400,000' - Fr Mbaka",Ụkọchukwu na- elekọta Adọration Ministry Enugwu bụ Fada Mbaka ekwuola na mmeri niile Hope Uzodinma na-enweta n'ụlọikpe si n'aka Chukwu.,"Fada Mbaka kpọpụtara ọtụtụ ọrụ Uzodimma ji n'aka dịka ụlọmmepụta ngwaahịa ọhụrụ o si ala bekee eweta n'Imo, nke o kwuru ga-enye mmadụ 400,000 ọrụ n'Imo steeti. Mbaka toro Uzodimma wee kwuo na nwa mgbe nta ọ nọrọ n'ọchịchị, anaghịzi eji ndị ọrụ ụgwọ ma ncha n'ihi na ndị ọrụ oyibo n'Imo na-erizi ụgwọọnwa kwa ụbọchị iri abụọ na ise n'ọnwa ọbụla." afirika-50154443,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50154443,"Career Choice: Ọrụ bekee na ịrụrụ onwe gị ọrụ, kedụ nke na-amasị gị?",Ọrụ aka mmadụ abụghị ihe eji egwu egwu.,Ya mere o ji adịmkpa ịkpachapụ anya n'ịhọrọ nke ga-abara gị. Lekwa uche ndị ntorọbịa Igbo gbasara isiokwu a. Akụkọ ndị ga-amasị gị media-48556561,https://www.bbc.com/igbo/media-48556561,Ụmụ Obiligbo: Ugbua anyị amatala na ego dị n'iti egwu,Okpuozor na Akunwafor bụ ụmụ ụmụ Ezigbo Obiligbo na-eti egwu Igbo.,Ha kọwara BBC Igbo etu ha si malite ịgụ egwu mgbe ha gụchara ụlọakwụkwọ. Umu Obiligbo kọwara ụfọdụ ọgbatuhie ha gabigara na njem egwu a. Gee ihe ha kwuru n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-43736952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43736952,Madrid mewara Juventus obi na champions League ụnyaahụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Nkwanye ugwu Ojukwu Ojukwu chiliri aka elu nye gọọmentị etiti na Jenụwarị 1970 iji kwụsị ọgụ Biafra. Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano na-akwado ikwanyere Dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ugwu n'ụzọ pụrụiche. O kwuru na ọ ga-emezi Ojukwu Bunker nke dị n'Amorka, n'okpuru ọchịchị obodo Ihiala, ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ga na-abịa njem nkiri. Ndọtị ụtụisi Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka a dọtịa ụbọchị eji emecha nkwuputa maka ihe onye nwere na ụtụisi. O kwuru ka ewega ya n'ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Juun, site n'ụbọchị iri atọ na otu (31) nke ọnwa Maachị ọ kwesịbụrụ ịgwụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị Nyocha Facebook Mark Zuckerberg bidoro Facebook n'afọ 2004 Mark Zuckerberg bụ onye nwe Facebook ka na-eme ọfụma n'agbanyeghị ọkụ ndị sineeti Amerịka na-akwanye ya n'ike. Kama ịda maka mmekpa ahụ ọ nọ n'ime ya, akụnaụba ya ka na-arigo elu. Cheta na ọ rịọrọ mgbaghara maka ịhapụ ka ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica na ụfọdị ndị ọrụ na mba Rọshịa were Facebook mee ihe masịrị ha. N'egwuregwu Cristiano Ronaldo nyere goolu nke iri anọ na otu nke afọ a n'ime asọmpi nke a Ndị Real Madrid mewara ndị Juventus obi ka ha ji otu ọkpụ goolu gbapụ ha n'asọmpi Champions league. N'agbanyeghị na Juventus nyere goolu atọ n'abalị ụnyaahụ, goolu atọ ndị Madrid nyere ha na be ha tinyere otu nke ụnyaahụ mere ka ha gafee ọkara-ikpeazụ. Mana Juventus tinyere nnukwu egwu n'ime ndị Real Madrid oge Mario Mandzukic nyere goolu abụọ n'ime nkeji abụọ eji bido egwuregwu nakwa n'ime nkeji iri atọ na asaa, ebe Blaise Matuidi nyere goolu nke atọ. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto. 'Ọrụ gị kwesiri ịbụ nke kachasị mma na foto'" 56715763,https://www.bbc.com/igbo/56715763,'Ebube Agu' ọ ga-ebute mgbanwe ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ?,Kedụ etu e si malite njem jedebere na nhibe otu nchekwa ebube agu?,Ọ bụ oke mwakpo na-arị ibe ya elu ọ kachasị mwakpo ụlọ ọrụ ndị uweojii. Lee ihe BBC Igbo chọpụtara mere n'ezie: Akụkọ nchekwa ala Igbo ọzọ ga-amasị gị: afirika-43166906,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43166906,CAN: Họọ ndị ọrụ nchekwa ọhụrụ,"Otu jikọrọ ndị otu Kraist nke a kpọrọ CAN n'aha ịchafụ rịọrọ ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari hazigharia ndị o tinyere n'ọrụ nchekwa ala Naijiria 'ndị si n'otu ofufe' dịka atụmatụ onye keta,ibe ya keta nke akpọrọ ""Federal Character"" siri hibe.","Rev Dr Supo Ayokunle nọchiri Ayo Oritsejafor dịka onye ndu CAN CAN kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ndụ ha nwere n'Abuja . N'akwụkwọ ozi CAN zigara ndị ntaakụkọ ka ha mechara nzukọ ahụ ha kwuru sị: ""Ala anyị nwere ọtụtụ agbụrụ na ọtụtụ ofufe. Anyi na-etiku onyesis ala Buhari ka ọ soro atụmatụ onye keta,ibe ya keta na-ike ọrụ gọọment nile. ""Anyị na-arịọkwa ka ọ hazigharịa ụlọ ọrụ nile na-ahụ maka nchekwa ala nyị ma tinye ndị ọhụrụ nwere ebumnobi tọrọ atọ."" Mana oge BBC kpọrọ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed n' ekwentị jụọ ya echiche gọọmentị etiti gbasara oku CAN kpọrọ, Mohammed kwuru na o nweghị ihe o nwere ikwu na ya bụ okwu. CAN gosịrị obi mwute maka ọtụtụ mmadụ e gburu na Benue, Taraba, Adamawa na Zamfara steetị ma katọ ndị ọrụ nchekwa maka egbochinwughị mkpamkpa ndị ahụ. Ha na rịọ kwa ndị ezi na ụlọ ndị nwụrụanwụ ka ha yicha anya ma chikọta obi ha. Ntuliaka 2019 N'ihe gbasara ntuliaka 2019, CAN rịọrọ ndị otu Kraist niile na Naijiria ka ha denye aha n'akwụkwọ ntụlịaka nke afọ 2019. Ma rịọkwa otu na-ahụ maka ntụlịaka na Naijiria bụ INEC ka ha kwụsị ịdenye aha ndị na-etorubeighị n'akwụkwọ." afirika-52853407,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52853407,"Democracy Day May 29: Etu Gọvanọ Ugwuanyi, Umahi na Ikpeazu siri chịa steeti ha n'afọ ise a","Taa bụ Mee 29,afọ 2020 ka o mere afọ ise ụfọdụ ndị gọvanọ nọ n'Ọwụwa-Anyanwụ bara n'ọkwa ọchịchị na steeti ha ga; afọ n'agba nke mbụ ọchịchị ha na otu afọ na-agba nke abụọ ha.","Nchọpụta BBC Igbo mere n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, ewumewu na-enyere ndụ aka (infrastructure) akụnaụba, onye kwuo uche ya (freedom of press) na ụfọdụ mere ọfụma, ebe ụfọdụ gbara ọnyụpa. Lee ka ha siri kwụrụ n'ọsọ oroma dịka o siri gbasa ịgbara ndị steeti tinyere ha n'ọchịchị odibo: Ifeanyi Ugwuanyi E duru Ugwuanyi n'iyi ọrụ n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee afọ 2015 ka o merichara na ntuliaka n'aha otu PDP. Ya bụ nwa amadi bụ onye si n'Orba dị n'okpuruochichi Udenu.. Onye kwuo uche ya E nwebeghị nsogbu ịkpachị ndị ntaakụkọ maọbụ onye ọbụla anọghị n'ọchịchị ikwu uche ya banyere ihe na-eme na steeti ahụ. Otu onye ntaakụkọ bi n'Enugwu bụ Tony Adibe sị, ""Kemgbe Ugwu anyị ji banye n'ọchịchị, anụbeghị na o nwere onye ntakụkọ a na-eji egwu."" Mwulite ihe na-enyere ndụ aka(infrastructure): Ndị Enugwu kwuru na Ugwuanyị gbalịrị na ịrụ okporoụzọ mana e nwere ụfọdụ ebe, ọkachasị n'ime obodo e lere anya na ụkpụrụ ụkwụ ya ga-eru mana o rughị ya. Adibe kwuru, ""N'ihe gbasara okporoụzọ, ụzọ na-arịọ arịrịọ enyemaka, ọkụ 'street light' kwesịrị ịdị, mmiri kwesịị ilebanye anya."" Nsogbu ụkọ ezigbo mmiri ọnụnụ bụ nsogbu talara nchara n'Enugwu dịka gọọmenti pụọ, ọzọ abata ma ihe na-ebe ka na-ebe. Mwulite ime obodo Ụfọdụ ndị Enugwu na-ekwu na o chetaghị ndị bi n'ime obodo n'ọrụ mmepe ya. Adibe kwuru, na ""Ọ gbalirị n'Akpụgo mana Udenu ebe nsogbu ide na mbize na-eme ire o nweghị ihe ọ rụrụ ebe ahụ."" Okezie Ikpeazu: Otu onye ntaakụkọ ma bụrụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Ndudim Nwaoha tụlere ọrụ gọọmentị gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti na ngalaba ndị a gụnyere; Mwulite obodo (Okporoụzọ): Nwaoha sị na gọọmentị Ikpeazu na-agbalị ike ya n'ịrụ ụfọdụ okporoụzọ n'Abia Steeeti dịka Ọsụsụ, Eziukwu dị n'Aba na ndị ọzọ. Kama na ihe mere ya dị ka ọ na-agba ọnyụpa bụ na ndị Abia na-atụanya ọtụtụ ihe n'aka ya karịa ka o si arụ ọrụ. Ọzọ bụrụkwa na o nwere ọtụtụ okporoụzọ ndị dị n'Aba e kwesịrị ilebanya kamgbe ndị ọchịchị gara aga nke a na-emebeghi ugbua. Okpotoụzọ ndị dịka Obiohia, Omuma nakwa ime 'Ngwa Road'. Nwaoha sị na ihe kpatara nke a bụ na ndị chịburu na mbụ emezighi nke ọma na ọ bụrụ na ha mere nke a na ọrụ gaara adịrị gọvanọ Ikpeazu mfe. Na nchekwa: Nwaoha sị na ọnọdụ nchekwa n'Abia Steeti adịtụla mma karịa ka ọ dị n'oge gara aga. Ọ sị na o nwere oge ndị mmadụ gbara ọsọ n'Abia n'ihi oke ohi na ntọrọ mmadụ mana ugbua na ndị mmadụ na ha alọghachị n'Abia maka na nchekwa adịtụla mma. Kama na oge ụfọdụ na a na-anụta akụkọ ohi na ntọrị n'ụfọdụ ebe. Na ọ ga-enye gọọmentị Ikpeazu akara pasentị iri ise na nchekwa. N'agụmakwụkwọ A bịa n'agụmakwụkwọ, Nwaoha sị na ọtụtụ ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị nwe eriela mperi, na ọnọdụ ha adịghịzị mma. Na i hụ ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị dịtụ mma, a sị na ọ bụ nke ngalaba dịka Universal Basic Education (UBE), Niger Delta Development Commission (NDDC) na Petroleum Trust Fund (PTF) rụrụ. Na nke a mere ọtụtụ nne na nna ji ewezuga ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ gọọmentị nwe ma tinye ha na nke ndị mmadụ nwe. Na nlekọta ndị ọrụ Bekee Ndudim Nwaoha sị na nke banyere ọnọdụ ịkwụ ndị ọrụ Bekee ụgwọ n'Abia Steeti edochaghị ihe ya anya. Na ndị ọrụ bekee na-ebe akwa na-eji ha ụgwọ ọnwa mana gọọmentị na-ekwu na ha akwụọla ndị ọrụ ụgwọ. Mana nnyocha BBC Igbo mere na nso nso a banyere nke a gosiri na e jighi ndị ọrụ bekee na mịnịstrị ụgwọ mana ụfọdụ ndị ọrụ ahụike na ndị nkuzi ka e ji ụgwọ. Kama ọnụ na-ekwuru gọvanọ Abia Steetị bụ Onyebuchi Ememanka sị na gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na ọ kwachara ụgwọ ndị a. David Umahi Dịka taa bụ Mee 29, 2020 mezuru ya afọ ise ọ chịwara, ọtụtụ ndị steeti ahụ ga-asị na Gọvanọ Umahi edebanyela aha ya n'ime obi ha site n'ihe ndị o merela na steeti ahụ. Ogochukwu Anioke bụ otu onye ntaakụkọ na steeti ahụ tụlere ọrụ Umahi n'ime afọ ise a, n'ebe ọ metụtara agụmakwụkwọ, ahụike, mwulite obodo, nchekwa na ọdịmma ndị ọrụ Bekee. Mwulite obodo (infrastructure): N'ihe gbasara mwulite obodo, ihe mbụ onye ọbụla ị jụrụ ajụjụ na steeti ahụ ga-agwa gị bụ na ""gọvanọ anyị na-agbalị n'ịrụ ụzọ na akwa"". Nke a bụ makana ọ bụ eziokwu na ọ rụọla ọtụtụ ụzọ e wusiri ike nakwa ụfọdụ akwa, ọkachasị n'Abakiliki bụ isiobodo steeti ahụ. Ka ọ dị ugbua, ọ na-ekwukwa okwu iwu ọdọụgbọelu, dịka ọ na-ewu ụlọmkpọrọ ọhụrụ n'isiobodo steeti ahụ. Ahụike: A bịa n'ihe gbasara ahụịke, ọ na-ewu ụlọọgwụ nke nkuzi mahadum a kpọrọ Ebonyi state University Teaching hospital, n'obodo Uburu dị n'okpuru ọchịchị Ọhaọzara. Ọ rụkwuola ebe a na-enyocha nje a kpọrọ ""virology center"" n'olu Bekee, ma tinyekwara ụfọdụ ndị ọzọ. Ọ bụ eziokwu na ọ rụrụ ihe ndị a gbasakwara nlekọta ahụike, mana Anioke kwuru na ọ ka fọtụkwara bụ ihe ndị ọ kwesịrị ime gbasara ọnọdụ ahụike na steeti ahụ. Ọ sị na a ka kwesịrị imetụ aka n'ihe gbasara ""community health centers"", na ọtụtụ n'ime ha enweghi ngwaọrụ nke ha ji enwe ndị na-arụ ebe ahụ, mere na ụfọdụ oge ị garuo ebe ahụ ị hụ na a gbachiri ha agbachi. N'agụmakwụkwọ: Ọ rụọla ụlọakwụkwọ maka ndị chọrọ ịbụ nọọsụ nke dịkwa n'Uburu. Ọzọ bụ na Umahi chọrọ ikpokọta ụfọdụ ngalaba dị na kọleji dị iche iche na steeti ahụ (ọ dị anọ), mee ka jiri ebe abụọ mere ụlọakwụkwọ. Anioke kwukwara na ọ na-agbalị imezi ụlọakwụkwọ praịmarị ndị nke a rụburu arụ. Nchekwa: N'ihe gbasara nchekwa, Anioke kwuru na Ebonyi bụ otu steeti ihe gbasara ohi na mpụ na-agbada, kama na ọrụ nchekwa bụ ihe dịrị mmadụ niile na-abụghị naanị gọvanọ. O kwuru na gọọmentị Umahi wepụtara ihe a na-akpọ ""neighbourhood watch"" ga-etinye anya na nchekwa, ma tinyekwara nke ọhụrụ a chọrọ imalite ugbua bụ nke a kpọrọ ""community policing"". O kwuru na ihe gbasara okeala ndị Ebonyi na Benue na Krọs Riva na-ebutekarị okwu na ogbugbu mmadụ, na isiokwu ya sitere n'ihe gbasara nkewapụta steeti mgbe e kewapụtara steeti ọhụrụ. O kwuru na ọ bụ okwu malitere tupu Umahi abata, mana ọ nwaala ike ya ịhụ na okwu gbasara ọzụzọ okeala biri. Ọdịmma ndị ọrụ Bekee: N'ihe gbasara ọdịmma ndị ọrụ Bekee, Anioke sị na ebe a bụ otu ebe ọ na-agahị ajanwu Umahi mma. O kwuru na ""A na-ekwu na Ebonyi steeti so na steeti ebe ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị nkuzi kacha pee mpe."" Ọzọ bụ na o kwuru na Ebonyi amalitebeghi ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe gọọmentị etiti tinyere n'iwu ka a na-akwụ ndị ọrụ. Lee ihe ndị na-eso BBC Igbo kwuru na gọvanọ ndị a merela na steeti ha: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ọchịchị onye kwuo uche ya." afirika-44050330,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44050330,Gọọmentị chọrọ itinyekwu n'afọ e ji agụ mahadum,"N'ihi na ọtụtụ ndị gụrụ mahadum ezughị oke na mmụta maka ịrụ ọrụ n'ụlọọrụ, gọọmenti etiti na atụghari uche itinyekwu otu afọ na afọ ole ụmụakwụkwọ mahadum na anọ n'ụlọ akwụkwọ.","Anwukah: Ndị mahadum Naijiria na-azụpụta anaghị egbo mkpa ndị ọrụ a chọrọ maka ụlọọrụ mmepụta ngwa ahịa Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Anthony Anwukah kwụpụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ndị isi ọchịchị mahadụm gọọmenti etiti na Naijiria. Anwukah kwuru na mahadum dị na Nigeria akpụọla afọ n'ala na ịzụpụta ndị ga-enyere Naijiria aka ịbụ mba bụ ọkaibe na imepụta ihe. N'okwu ya; ""Ndị na-agụ maka iwu na-aga ụlọkwụkwọ iwu otu afọ, tupu ha agawa maka ife ala nna anyị, ndị gụrụ maka ahụike na aga ọzụzụ otu afọ, ya mere ọ ga-adị mkpa ka ndị ọzọ na agụ ihe ndị ọzọ mee ka ndị a."" O kwuru na ọ ga-adị mma ka ha na-aga ụlọakwụkwọ Lagos Business school maka ọzụzụ pụrụiche. Anwukah onye tụrụ arịrị na ndị mahadum Naijiria na-azụpụta anaghị egbo mkpa ndị ọrụ chọrọ maka mmepụta ngwahịa ma ja ha ike ka ha nye aka kwalite agụmakwụkwọ na-ada ada na najiria. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44788806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44788806,Bishop Chukwuma: Ọ bụ ndị amụma ụgha ga-asị gị kwụọ ụgwọ ekpere,Ị gatụla ebe a na-eburu gi amụma? Ihe ha gwara gị ọ bịara na mmezu?,Kirie ka e si wee buoro nwaanyị mụrụ ejima atọ amụma. Gerekwa ndụmọdụ ndị ụkọchụkwụ dịka Archbishop Chukwuma nke Enugwu steeti nyere gbasara isiokwu a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 43528162,https://www.bbc.com/igbo/43528162,Dapchi: Ndụ amalitela na Dapchi ọzọ,Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na ebe niile dara jụụ n'obodo Dapchi ebe egwu na-atụ ndị mmadụ maka na ha nwetara ozi na ndị Boko Haram na-abịa ọzọ.,"A tọrọ ụmụakwụkwọ ruru 110 na Dapchi na Ferburuwarị Onye nọ n'ebe ahụ gwara BBC na ndị mmadụ akpọchichala ọdọ ahịa ha ma kpochie ebe obibi ha. O kwukwara na ndị agha Naịjiria nọ na Dapchi anọzịghị ebe ha kwesiri ị nọ na-eche nche na Dapchị. Ndị Dapchi na-atụ egwu maka na ha amaghị ihe ndị Boko Haram na-abịa ịme, mana e chere na ọ bụ ịtọghapụ otu nwa nwaanyị fọrọ na ndị ha nwụchiri bụ Leah Shaibu. Ndị ahụ alaghachitala ebe ha anụghị ụda ụkwụ ndị Boko Haram maọbụ hụ ha ka ha sị nụ na ọ ga-eme. Ndị Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ ruru otu narị na iri n'ọnwa Febụwarị ma tọghapụ ha ka izuụka atọ gachara. Akụkọ ga-amasị gị:" 42845895,https://www.bbc.com/igbo/42845895,Onye na-arụ dịka onyeisiala mba Ghana aṅụọla iyi ọrụ,Nke a bụ ugbo abụọ n'otu izuụka onyeisi ụlọ omeeiwu mba Ghana ga-aṅụ iyi ọrụ inochi onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addorue ụbọchị 31 Jenuwarị .,"Mahamudu Bawmia na-arịa ọrịa ya kpatara onyisi ụlọ omee iwu jiri nọchite anya onyeisiala Onyeisiala Nana Akuffo-Addo gara mba Etiopia maka nzụkọ ndị mba Afrịka niile a na-akpọ AU n'aha ịchafụ. Ọ gasịa nke ahụ, ọ ga-aga mba Sout Afrịka maka akwamozu onye ogbu opi jaz bụ Hugh Masekela. Ụlọ omeiwu Ghana duru onyeisi ha iyi ọrụ maka na osote onyeisiala mba Ghana bụ Mahamudu Bawumia nọ ezumike maka ahụike ya na London dịka ahụ bidoro ịya ya n'izu gara aga. N'ụka gara aga, Oquaye nọchiri onyeisiala ozigbo dịka onyeisiala Akuffo-Addo gara mba Liberia maka nnabata George Weah dịka onyeisiala. Onyeisiala Naịjịrịa agawala otu nzụkọ ahụ ebe ha ga-akpa maka agha a na-ebuso mpụ na mpaghara Afịrịka niile." 43237577,https://www.bbc.com/igbo/43237577,Sineti : A ga-akwụgbu onye a mara ikpe okwu asị,"A ga-akwụgbu onye ọbụla a mara ikpe na o kwuru okwu asị nke butere ọnwụ onye ọzọ, ma ọ bụrụ n'iwu ọhụrụ nke dị n'ụlọ omeiwu ukwu nke Sineti nweta nkwado ha niile.","Ọ bụrụ na Sineti kubie gavelụ n'iwu okwu asị, a ga-akwụgbu onye dara iwu a Dịka iwu ahụ a na-akwado siri kwuo: ""Onye ọbụla jiri, depụta, gosi, mepụta, nye, kesaa maọbụ hazie ihe ederede maọbụ ihe onyonyo nke na-akparị maọbụ na-eyi egwu, dara iwu."" Ọnụ na-ekwuchitere Sineti bụ Sinatọ Aliyu Sabi bụ onye otu APC, tụpụtara alo a ka-akwado iwu a ga-eme ka akwụgbuo onye dara a. Iwu ahụ na-ekwukwa ka e mepụta ngalaba na-ahụ maka okwu asị nke ga n'eleba anya n'iwu gbasara okwu asị n'akụkụ Naijiria niile ma gbaa mbọ hụ n'ewepụrụ ọkwu asị ma n'enye gọọmenti etiti ndụmọdụ. Mmerụ iwu a dịka inye mmadụ nsogbu dịka o siri gbasa agbụrụ onye si maọbụ ileda mmadụ anya maka agbụrụ o si, ga-apụta ịga mkpọrọ afọ ise maọbụ ịkwụ nde naira 11 maọbụ ha abụọ dịka ntaramahụhụ.""" afirika-49620029,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49620029,Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo,Ndị Mmaku gosiri BBC Igbo etu ndị ọgba dị icheiche siri zọọ ndụ ndị obodo n'oge agha mgbe gboo.,Ha kọwakwara ụzọ dị icheiche esi akwanyere ọgba ndị ahụ ugwu. Ndị Mmaku gosikwara uru ọgba ka na abanyere ha rue ụbọchị taa. Gee ihe ndị ha kwuru n'uju ebe a: Ọrụ a si n'aka: Chiagozie Nwonwu na Chiemela Mgbeahuru Akụkọ ndị ga-amasị gị: 43237576,https://www.bbc.com/igbo/43237576,Onyeisi ndị uweojii: Mepe ọdọ ehi tupu ị machie ịchịgharị ha,Onyeisi ndị uweojii kwuru nke a ụnyaahụ na kaduna na nzukọ ndị nchekwa obodo metụtara sịrị na ọ ga-enye aka igbara nsogbu na adapụta n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi.,"Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ekwuola ka steeti bụrụ ụzo wapụta ala ebemaka ọzụzụ ehi tupu ha amachie ịchigharị ehi Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu dapụtara na Benue bụ maka na gọọmenti steeti ahụ ehibeghị ọdọ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi Na nzukọ ahụ nke isi okwu ya bụ, ""Nkwalite obodo: Nsogbu nchekwa na mkpa ọ dị ịchọta ụzọ zuru oke ịkwụsị ya,""nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi ebidoghị n'oge ọchịchị onyeisiala bụ Muhammdu Buhari. Idris kwuru sị:""N'uche m, iji belata ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi, gọọmenti steeti ga-agba mbọ wuo ebe ọzụzụ ehi na steeti ha tupu ha eme iwu ikwụsị ịchịgharị ehi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47484577,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47484577,Imo State Election 2019: Uche Nwosu ka so n'ihe a na-eme - FCC Jones,Ọnụ na-ekwuchitere Pati Action Alliance bụ Onwuasoanya FCC Jones akatọla akụkọ na-ekwu na Uche Nwosu esoghizi azọ oche gọvanọ na ntuliaka n'Imo steeti.,Ọ katọkwara okwu na-ekwu na gọvanọ Rochas Okorocha na-echegharị maka ịkwado pati AA na ntuliaka na-abịanụ. Jones kwuru na okwu niile a bụ ụgha ma na-ekwukwa na Okorocha ka kwụsị ike na-azụ Uche Nwosu nakwa ndị niile na-azọ oche ụlọomeiwu nke steeti n'okpuru pati Action Alliance. Ọ rịọkwara ka akụkọ ụgha a ghara ime ndị ụmụ Imo gbajọọ itunyere pati AA na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ nakwa ụlọomeiwu nke steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55064380,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55064380,Hajia Sefia Ali nwaanyị awụsa na-ata asụsụ Igbo ka ọjị,Hajia Safiya Ali bụ nwaanyị Sokoto birila n'Enugwu ihe karịrị afọ 25 kọwara etu ihe ndị Igbo ji amasị ya nke ukwuu.,"Ali gwara BBC Igbo na ahụ kpakọrọ ya ọnụ kamgbe ọ malitere ibi n'Enugwu karịa dị mpaghara ugwu bụ ebe o si bịa. Ọ sị na ndị Igbo anaghị enye ya na ụmụ nsogbu chaachaa kama na ha na-enyere ya na ezinaụlọ ya aka. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Nnamdi Agbanelo Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46334073,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46334073,Akụkọ ndị dị mkpa taa: 'Ndị Abịa chekwaanụ vootu ụnụ',Alex Otti sị n dị Abịa chekwa vootu ha,"Akụkọ dị mkpa taa bụ ụka: Alex Otii,onye bụbu onyeisi ụlọakụ Diamond Bank zọburu ọkwa Gọvanọ Abịa steeti na ntuliaka 2015 Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abịa steeti n'aha ndị otu APGA bụ Alex Otti ekwela ndị Abia nkwa na ya ga-agba mbọ ịhụ na a naghị ya mmeri ndị na-akwado ga-enye ya na ntuliaka na-abịa na 2019 ma rịọ ndị Abia ka ha chekwaba vootu ha. Otti kwuru nke a n'ọgbakọ obodo nke ndị APGA nwere na Legos, ụbọchị Satọde. Mmadụ itoolu na-arịa ịba-uhie Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria a kpọrọ ""Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) "" ekwuola n'ezie na ịba-ụhie ejidela mmadụ itolu n'Edo steeti. NCDC kwuru na e zigala WHO ọbara ndị ahụ ịba ahụ a maghị ihe butere ya si n'okpuru ọchịchị anọ n'Edo maka ịganihu na nyocha ahụ. Ịbịa-uhie nke a kpọrọ 'yellow-fever' na bekee bụ ọrịa na-agbasa ma anwụnta bu ya taa mmadụ. Otu Igbo chọrọ ka gọọmenti kpopụ ndịagha n'ala Igbo Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Otu World Igbo Congress akpoola gọọmenti Naijiria oku ka ha kpọbu ndị agha Naijiria ha kpojuru n'ọwụwa anyanwụ Naijiria, ma tinye uchu n' Ugwu Awụsa ebe ndị Boko Haram na-akpa ike gburu ọtụtụ ndị agha na nso nsọ a. Buhari egosila obi mgbawa Ka abali isii ọdachi a mechara, Onyeisiala Naijiria bụ Muhammdau Buhari ekwupụtala obimgbawa maka ndị agha Naijiria e gburu ụbọchị ụka gara aga. Ndị omekataraihe daaụjọ Boko Haram na ogbo ha IS nke ọdịda anyanwụ Afrika gburu ihe karịrị ndị agha Naijiria iri anọ na Metele dị na Borno steeti ụbọchị ụka gara aga. N'egwuregwu, Mịnịsta na-ahụ maka ndị ntorobịa na egwurekwu bụ Solomon Dalung etoola otu Super Falcon maka inweterela Naijiria ọnọdụ isonye n' ọkara ikpeazụ nke asọmpi iko Afrika nke ụmụnwaanyị ga-agba na mba Ghana. Ndị Falcon jiri okpu isii gosi ndị ndị Equatorial Guinea nkarị n' asompi ha nwere na Cape Coast ụbọchị Satọde." afirika-44190366,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44190366,Aka akparala nwaanyị chọrọ iji ogbunigwe egbu ndị mmadụ,Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa.,"Boko Haram na-eji zi ụmụnwaanyị kwara ngwagha ogbunigwe mgbagbuonwe Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ. Uwe ogbunigwe Ozi a dị n'akwụkwọ osote onụ na-ekwutere ndị agha Naịjirịa bụ Col. Onyeama Nwachukwu wepụtara. N'okwu ya ""Nwaanyị a batara n'ụlọ ndị alakụba mgbe ha chọrọ ịmalite ekpere, n'atufughi oge ndị a nwuchiri nwaanyị ahụ ma nyefe ya n'aka ndị agha nọ n'Azare."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Boko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ" afirika-49127942,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49127942,Onitsha Truck accident: Ndị Uweojii anwụchiela ọkwọụgbọala gwongworo dagburu mmadụ abụọ n'Onitsha,"Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na aka ha akparala ọkwọụgbọala gwongworo dagburu mmadụ abụọ n'Ọnịcha, Anambara steeti.","Ọkụekwe ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, onye gwara BBC Igbo nke a, kwukwara na ihe mberede ahụ mere oge gwongworo ahụ na-agbalị ịghọ onwe ya ada. ""Ọ dakwasara keke abụọ na otu ụgbọala na-ebu ndị mmadụ ka ọ na-eze ụzọ ọjọo."" Ebe e nwere uchu,olileanya dị. ""Mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na ụgbọala na-ebupu nke dachiri ụzọ akpụpụla ụgbọala ndị ihe mberede ahụ metụtara, ebe niile dekwara jụụ n'okporoụzọ ahụ ugbua." 43187341,https://www.bbc.com/igbo/43187341,Mmadu 3 na-eku mmanụ na gwongworo n'Ikorodu anwụola,"Ụmụnwoke atọ so na ndị nọ na-eku mmanụ nrị na-agbapụta na gwongworo daala n'Odogunyan bụ obodo di n'Ikorodu na Legos steeti nwụrụ, otu nwanyị merụrụ nnukwu ahụ.","Gwongworo bu mmanụ ụgbọala na adakarị na Naịjirịa Ihe mberede a mere na ụtụtụ ụnyahu ka gwongworo a dara ka o n'eru ebe a kpọrọ 'Sabo Garage' n'Ikorodu. Ka ihe a mere, ndị mmadụ che na ọ bụ mmanụ ụgbọala ka gwongworo a bu gbagara ebe ahụ iku mmanụ. Ọ ka ha no na-eku mmanụ ka isi gwongworo a dala sụgbụọ mmadụ atọ n'ime ha. Otu nwoke na nwaanyị n'ime ndị a na-eku mmadụ merụrụ nnukwu ahu. Ha nọ zi na ụlọọgwụ 'general' na Ikorodu na-anata ọgwụggwọ. Otu nwoke hụru ihe mberede a sị na mgbe gwongworo a dara, isi ha kopuru. Onyeisi ndị gbata gbata na Legos bụ 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA), bụ Adesina Tiamiyu, sị na ha ma maka ihe mberede a, ma na-ariọ ndị na-anya ụgbọala ka ha na-akpachara anyị ma dobe iwu okporo ụzọ, ma yokwa ka ha n'enyocha ụgbọala ha tupu ha etinye isi n'ụzọ." 42725985,https://www.bbc.com/igbo/42725985,'E kwenyere m na ọdighi ihe di iche n'etiti nwaanyị na nwoke' - Chimamanda,"Onye odee akwkụkwọ a ma ama a na-akpọ, Chimamanda Ngozi Adichie ,bịara njem nleta ndị BBC Igbo n'ụlọ ọrụ ha dị na Legọs n' ụbọchị Wenezde.","Chimamanda asọghị okwu mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụ maka nhata nha dị n'etiti umunwoke na umunwaanyị Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ ihe bụ uche ya gbasara nhata nha nọ n'etiti nwoke na nwanyị, Ọ sị n'ime onwe ya na o kwenyere na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ otu n'anya ya. Nke a mere na oke niile ruru umu nwoke aka kwesiri irukwa ụmụnwanyị aka karịcha ugbu a ihe niile na-agbanwe agbanwe. BBC Igbo nabatara Chimamanda ọfụma" afirika-44088606,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44088606,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ogbuagu sị sonye na ntuliaka,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Uche Ogbuagu rịorịọ Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ntụliaka Uche Ogbuagu kwuru na Biafra ga abịa na mezu site na ezi echiche Dike Igbo ama ama na-ịkpa ụka ọchị bụ Uche Ogbuagu arịọla ụmụ ntotobịa Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọgbuagụ rịorịọ arịrịọ a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụnyahụ n'obị ya n'Ikeduru, Imo Steeti bụ ebe ọnọrọ riọ ụmụ ntọrọbịa ka ha ghara iji akpịrị ego refuo ikike ha nwere iji weta mgbanwe tọrọatọ n'ndụ ha. Ọdachị daara ndị otu CAN Musa Asake Ode akwụkwọ otu jikọtara ndị otu kristi na Naịjirịa akpọrọ CAN n'aha ịchafụ bụ Rev. Musa Asake alala mmụọ ka ọrịachara ọbere ọrịa. Onyeisi mgbasa ọzị ndị otu a bụ Pastọ Adebayo Oladeji gwara ndị nta akụkọ nke a mgbe ya na ha nwere mkparịta ụka. Iran akwadola mba Syria ka Izrelu tụchara ha ogbunigwe Mba Iran akwadola ndị Syrịa dika mba nwere ikike ịkwuru onwe. Iran kwuru nke a ka Izrelu tụchara ogbunigwe na ihe ha hutara dika ka ọdọ ndị agha ndị Iran dị na Syria ma katọkwa ụma Izrelu mere. N'egwuregwu UEFA eriela Gianluigi Buffon iwu Gianluigi Buffon Kparịrị ogbu opi na bọlụ ndị Juventus na Real madrid N'egwuruegwu, otu UEFA amala Gianluigi Buffon nke Juventus Ikpe ka ọkparịchara onye ogbu opi na asọmpị ha na Real madrid. Nke a mere ka ogbu opi ahụ nyechere ndị Real Madrid penariti dịka ọfọrọ tinkọm tinkọm ole ka egwu bọlụ ahụ bie. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Ị mara ihe ọfọ bụ n'ala Igbo? Gịnị bụ ọfọ? Akụkọ ndị ga-amasị gị" media-48509624,https://www.bbc.com/igbo/media-48509624,Enyinnaya Abaribe: Ihe Ndigbo chọrọ bụ ka e mee anyị ka e mere ibe anyị,"BBC Igbo gbara Enyinnaya Abaribe ajụjụọnụ maka ọnọdụ Ndigbo na Naịjirịa, o kwuru ọtụtụ ihe miri emi maka ọnọdụ Ndigbo.","Ọ na-ewute ya na gọọmentị jụrụ ịkpọ ndị Boko Haram ""Terrorists"" ma machie Ipob n'ọnweghị ihe ha mere. Ọ sị na ọ dịghị mfe ime ka obodo Naịjirịa bụrụ nke ndị Alakụba. Ọ sị na ya agaghị agba ama ihe ndị pati ya bụ n'obi ganye na ha ezukọọ maka ịhọpụta onye ndu ụlọomeiwu ukwu. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo" afirika-47073303,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47073303,Amnesty to Looters: Oka mma karịa ị na-egbu oge n'ụlọikpe - Ndị ọkaiwu,Ndị ọkaiwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ọwụwa-anyanwụ ekwuola na atụmatụ ịgbaghara ndị zuru ego ma ha weghachi ego ha zuru ga-enye ohere ka Naijiria nweta ego gọọmenti e zuru ezu ọsịsọ.,"Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru PDP kwuru n'oge mkparịtaụka a kpọrọ ""The Candidates"" nke ụlọakụkọ NTA mere kwuru a ga-esi ụzọ a nata nde kwuru nde Naira ego ezupuru n'akpaego Naijiria. Ọkaiwu Anthony Okah kwuru na ikpe ndị a na-ekpe ikpe na ha zuru ego Naijiria na-anọ afọ ise, iri na enweghị onye a natanwuru ego. Okah gara n'ihu kwụọ na ""ọ ga-eme ka a nata ego ozuru ezu ọsịsọ."" N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ben Igweenyi kwuru na ""O nweghị ihe dị njọ"" na ya bụ atụmatụ. O kwuru na a na-eme ya, e tinyekwara ya ụzọ ndị ọsọ na-alụ ọgụ megide nrụrụaka. Amnesty for looters: Jonathan mere ya, Buhari mekwara ya Ọkachamara n'ihe gbasara okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chunonye Okereke kwuru na atụmatụ ahụ nke ọ kpọrọ ""plea bargain"" ga-enye aka napụta ndị zuru ego Naijiria ihe ha zuru na-egbughị oge, nakwa na- emefughị ego a na-emefu na-ikpegharị ikpe n'ụlọikpe. Okereke kọwara na ihe Atiku kwuru abụghị ihe ọhụrụ n'ihi na Goodluck Jonathan na Muhammadu Buhari mere ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44407355,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44407355,Akụkọ kachasị n'abali a: Sineti kwadoro Buhari banyere Juun 12,Akụkọ ndị dị mkpa mere taa:,"Ụlọomeiwu ukwu ekpebiela ka akpọpụta MKO Abiola na Babagana Kinigbe dịke onyeisiala na osote onyeisiala na ntụlịaka e mere n'afọ 1993. Ha kwukwara ka Inec wepụta mpụta ntuliaka Juun 12 afọ ahụ iji kwado omume onyeisiala Muhammadu Buhari mere ụbọchị iri na abụọ nke Juun dịka ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya. N'akụkọ ofesi End of Twitter post, 1 A tụọla otu nwoke nga mkpụrụọka maka igbu nne na nna ya nakwa nwanne ya nwoke. Henri Van Breda nke mba Saụt Afrịka onye ji onike gbuo ndị ezinaụlọ ya n'ụlọ ha na Janụwarị afọ 2015 ga-agakwa mkpọrọ maka ịnwale igbu nwannne ya nwaanyị ọ tọrọ. N'Egwuregwu, Onye nkuzi otu Super Eagles Gernot Rohr kwuru na ha adịbeghị njikere ịgba asọmpị mbụ ha n'etiti ha na Croatia mere ha jiri laghachi na nkwado. O kwuru na mmeri ha ewuteghị ya maka na ọ bụ na Rọshịa ka ihe ha na-agba ga adị mkpa. Ebe NFF na-echeta Stephen Keshi mgbe taa June 7 mezuru ya otu afọ kemgbe ọ nwụrụ. Ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa. Gee nkeji nke mgbede anyị ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akukọ ga-amasị gị:" afirika-57005544,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57005544,Orlu Attack: E gbuola ndị 'unknown gunmen' asatọ chọrọ iwakpo ogige ndị uweojii,Obodo Ọlụ dị n'Imo steeti na-ekpo ọkụ ọkụ n'ime abalị ụbọchị nke isii nke ọnwa Mee dịka ndị bu egbe wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo ahụ nke butere ọnwụ mmadụ asatọ n'ime ndị mere mwakpo ahụ dịka a napụkwara ha ụgbọala ha jiri bịa ọgụ.,"Ndị Ji egbe n'Orlu Ndị uwojii Imo kwuru na ha nwetara egbe AK 47 anọ, otu egbe 'pump action', ụgbọala Toyota Siena abụọ, otu ụgbọala 'Toyota Camry', otu ụgbọala Toyota Hilux , otu ụgbọala SUV Highlander, ụgbọala SUV Land Rover, otu ụgbọala Nissan Pick up na ọgwụ ọdaeshi. Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndi uweojii na ndị agha Naịjirịa tinyere aka were hụ na mwakpo a agaghị etu ndị kpara nkata ya jiri chọọ. Ndị ji egbe a na ndị ọrụ nchekwa kwara mgbọ ruo ọtụtụ awa dịka ndị agha si Obinze bịara soro ibuso ndị ji egbe a ọgụ. Ihe onyonyo e tinyere na Facebook gosiri oge ndị ji egbe ji ụgbọala ha bata Ọlụ, tupu ha na ndị Ọlụ nchekwa akwawa mgbọ n'ime abalị. Ịkwa mgbọ a mere ka ụjọ baa n'ahụ ọtụtụ ndị mmadụ bi n'Ọlụ nke mere ụfọdụ n'ime ha gbara ọsọ gawa Owere. Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu Otu onye bi n'Ọlụ gwara onye ntaakụkọ ya na BBC Igbo kwuru na-agbara otu ụgbọala agha ndị agha ọkụ n'Umuna Junction. O nwekwara ndị a na-ekwu na mgbọ tụrụ mana BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete nke bụ eziokwu.BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Godson Orlando Ikeokwu mana ọzaghị ekwentị ya. Onye ntaakụkọ ya na BBC Igbo kwuru sị na o nweghị onye uweojii nwụrụ na mwakpo a. Ọ sịkwa na eburula ozu ndị a egburu na ụgbọala a nwụchịrị gawa Owere bụ isi obodo Imo steeti. Ọ bụ ụnyaahụ ka onyeisi ndị uweojii ọhụrụ bụ Abutu Yaro malitere ọrụ n'Imo steeti. Owerri Prison Break: Ọ dịghị mma etu onyeisi uweojii jiri bo ipob na emeghị nchọpụta - Uwazuruike" afirika-44857129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44857129,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọchịchị akaike abatala Naịjirịa - Ohaneze,Ọdịka ọchịchị akaike abatala Naịjirịa,"Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo akwala arịrị na ihe na-eme na Naịjirịa ụgbụa na egosi na ọchịchị aka ike abatawala obodo a. Nwodo kwuru nke a ụnyahụ ebe ajụrụ na ụgbọelụ ndị ọnụ na-erụ na okwụ na ndịda Naịjirịa jị bata Markudi bu isi obodo Benue steeti agaghị ada. Abụbụ ọrụ na-esi Ndí isi otu ndí ọrụ Naíjíría Otu jikọtara ndị isi ọrụbekee bụ Association of Senior Civil Servants Agbarụọla ihu maka nkagbụ akagburu ụle mbụli elụ na ọrụ nke ndị otu ha gara n'Abụja. Ode akwụkwụ ndị otu a bụ bashhir Lawal dọọrọ aka na ntị na ọbụrụ na akwụchịghị ndị otu na gara ya bụ ụle akagburu ụkwọ ha jiri ga ya bụ njem, na abụbụ ọrụ dị egwu ga esochị ya na-azụ. Trump na Putin ezukoola Ameríka na-ebo mba Rọshịa ebubo ịkpa akaala na ntuliaka ha mere n'afọ 2016 Nkato esochiela njem nleta Onyeisiala Donald Trump na Valdmir Putin nke Russia mere na Finland. Onye ọnụ na erụ na ọkwụ na Pati Republican bụ Paul Ryan gwara Trump ya cheta na Russia abughị enyi mba Amerika. N'egwuruegwu Cristiano Ronaldo bidoro iji bọọlụ akpata ego oge ọ dị afọ 12 ka ndị otu egwuregwu Sporting CP dị na mba Pọtụgal ji £1,500 zụta ya Dịka egwuruegwu iko mbaụwa bịara n'isi njedebe, Cristiano Ronaldo etinyela aka n'akwụkwọ ịgbara ndị otu egwu bọọlụ Juventus nke Italy. Ronaldọ si na obi dị ya ụtọ ịbata Juventus ụgbụa ebe ndị ọgbọ ya na aga mba China na Qatar. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise ọmere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee" afirika-43982866,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43982866,Akụkọ kachasị n'abalị a: Igbo latanụ maka ncheta Bịafra - Zionists,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Zionist Movement si ụmụ Biafra lọta ala Igbo Ndị otu Biafran Zionists Federation sị na ha ga ebuli ọkọrọtọ Biafra na obi gọọmenti Enugwu steeti ụbọchị 30 Mee Ndị Otu Zionists movement akpọlaa oku ka ụmụ Biafra nọ n'oru na Igbo lọta na mkpuru ụbọchị IRI ATỌ NKE onwa May. Ha sị na nnlọtaa ga-enye aka ị me ncheta maka ụbọchị Ojukwu nyere iwu ka Biafra diri. Ibrahim Idris sị na ya agaghị aza ndị Sineti Nke bụ ugboro abụọ onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris azaghị oku ndị Sineti kpọrọ ya Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim IDRIS agbala isiaK wara na ya agaghị aza oku ndị omeiwu ukwu kpọrọ ya. Ha sị ya bịa kọwa maka ajọ aka ha kpara onye otu ha bụ Dino Melaye mgbe ha jidere ya. Na mba ofesi Stephen Hawking chisara ọwara na 14 March 2018 Ọnye ọkamuta lara mmụọ bụ Stephen Hawkings chọpụtara na ụwa a anyị nọ n'ịme ya nwere oyiri. Akwụkwọ nchọpụta were ya ọgụ afọ pụtara ihe abali 10 tụpụ Hawkings a laa mụọ. N'egwuregwu Nwoke aha ya bụ Sean Cox (53) zọrọ ndụ ya azụ site na ihe ndị nkwado Roma kụrụ ya ka agbachara bọlụ ụbọchị Tuzde gara aga Ndị egwu bọlụ Liverpool a dọla ndị nkwado ha aka na ntị ka ha a nwakwala anwa were ụkwụ gaa maọbụ laa mgbe ha ga abịa ikiri egwu bọlụ nke ha na ndị Roma FC ga -agba na mgbede a. Ha sị ka onye ọbụla gba mbọ baa ụgbọala maka egwu ndị nwakpo dịka ọ dị n'izu gara aga. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Akụkọ ihe mere mgbe ekpuhere ""Sweet Codiene"" na legos na ịchafụ. Ndị bịara ngosi ihe onyonyo BBC mere maka Codeine na ihe ha kwuru Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42807381,https://www.bbc.com/igbo/42807381,'Mmadu abuo anwụọla na Imo steeti' - Komishọna ahụ ike,Angela Uwakwem kwuru na mmadụ asaa nọ n'ụlọ ọgwụ maka ọrịa Lassa fiva.,Lasa egbuola mmadụ iri na isii Imo Steeti so na steeti iri ebe e nwere ọrịa lasa fiva n'ala Naịjirịa. Uwakwem na-akpọku ndị ntaakụkọ ha jịrị ohere a nye aka ma kuziere ndị mmadụ ihe egwu dị n'iri ihe oriri nsị maọbụ mamịrị oke metụtara. Akukọ ka na-abia Maka lassa fiva. 42861134,https://www.bbc.com/igbo/42861134,Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ ASP Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ndị uwe ojii ebidola nyocha mmadụ iri abụọ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị Fulani na-achi ehi dị dabatara na mpaghara Opeji nke Ogun Steeti.,"Ndị Fulani na-achị ehi egbuola ihe karịrị mmadụ otu nari n' izu atọ gara aga O kwuru na ndị Fulani ahụ si okpuru ọchịchị Kaiama nke dị na Kwara Steeti biara ịza oku nke eze obodo Opeji kpọrọ ha ka ha bịa biri ma na-achị ehi n'ala ahụ. ASP Oyeyemi gara n'ihu gwa ọra obodo ka ha were ọbi nwayọọ gawa ihe bụ mkpa ha na atụghị egwu ọbụla n'ihi na ndị uwe ojii adịla njikere ichekwa ndụ na akụ na ụba na steeti ahụ. Echiche ndị mmadụ Otu onye Opeji bụ Babatunde Adesoji gwara BBC na egwu na obi mmapụ ejidela ndị obodo ha kemgbe ndị Fulani na-achị-ehi wuchiri obodo ahụ na ngwucha izu ụka. O kwuru na mwakpọ ndị Fulani na-achị-ehi wakporo ndị nkuzị abụọ n' ụlọ akwụkwọ, Atola Primary School dị na okpuru ọchịchị Ewekoro-North ebutela egwu n' obi ndị mmadụ. Ndị uweojii nwụchiri ụfọdụ ndị Fulani maka mwakpọ ndị nkuzi mana ha chọpụtara na ndị ha nwuchiri abụghị ndị omekaome ahụ kama ha bụ ndị bibụ n'obodo ahụ. Cheta na n' izu atọ gara aga, ndị Fulani na-achị ehi gburu ihe karịrị mmadụ iri asaa na Benue Steeti. Abali ole ma ole garara aga, ogbaghara dị na etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na Plateau Steeti tara isi ihe karịrị mmadụ iri. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada" afirika-47764464,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47764464,Eji m ụbọ Bekee m akwalite egwu ifo na omenala Igbo - Chinyere Ifechukwu,"Egwu Chinyere Ifechukwu na-eju isi ozi, ọkachasị etu osi erotere mmadụ egwu ifo a na-agụ na nwata.",Mana ihe kachasị mee ka egwu ya pụọ iche bụ ngwa egwu oji akwalite ya. Ọ sị na uche ya bụ na o dị mkpa ị hu na omenala Igbo bụ ihe digidere. Gee ya nti n'elu: Akụkọ ndi ọzọ ga-amasị gị Mana ihe kachasị mee ka egwu ya pụọ iche bu ngwa egwu oji akwalite ya. Ọ sị na uche ya bụ na o dị mkpa ị hu na omenala Igbo bụ ihe digidere. Gee ya nti n'elu: afirika-52363418,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52363418,N1.59trn FG Loan: Gọọmenti ga-ebitezi ya n’ụlọ,Gọọmenti etiti Naịjirịa ebugharịala ọnọdụ na ya bụ ego mgbazite ha chọrọ ibitebụ ndị mbaụwa maka iji mezuo ego ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afo 2020.,"Gọọmenti Naịjirịa tinyeburu ego dị ijeri narị naịra asatọ na iri ise (N850 trn) dịka ego ha ga-agbazite ndị mba ofesi ebe ha ga-agbazite ijeri narị Naira asaa na iri itoolu na anọ n'ụlọ maka imezu ego ha chọrọ iji rụọ ọrụ n'afọ 2020 a. Na mkpụrụ ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2019 ka ndị ọmeiwu Naịjirịa tinyere aka n'akwụkwọ maka ego dị ijeri Naịra iri na ụma (N10.59trn) bụ nke ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afọ 2020. Ego a ji ihe dịka pasenti 1.52 gbaa mpe; atụgharịa ya na ego ọbụrụ otu ijeri naịra na ụma iri ise na abụọ (N1.52 trn) bụ nke ha chọrọ ibite na mba ofesi iji mezuo ọgụ. Ụlọọrụ Debt Management Office (DMO) sị na ụgbụa, na o nweghịzị nke ha ga-agbazite n'ofesi. N'okwu ha n'ụbọchị Wenezde, DMO sị na, ""echiche a bụ maka ka ihe siri dowe ihu n'ụwa ugbua maka agha Covid 19 a bụ ozuru mba ọnụ"". Gịnị dị iche n'ịgbazite ego n'ụlọ na ịgbazite ya n'ofesi? Onye ọkachamara n'okwu akụnaụba bụ Uche Uwaleke gwara anyị na ihe dị iche dị. Uwaleke sị na ihe mere o ji dị mma ibite ya bụ ego n'ụlọ bụ maka dọla iri elu karịa ka ọ dị ugbua. Ọ kọwara na ọ bụrụ na dọla rịa, na ọ ga afụ ụfụ n'ahụ ịkwụ ya bụ ụgwọ maka na ego ọmụrụnwa ya ga-arịkwa. Mana agbanyeghị, dịka okwuru, ibite ego na mba ofesi na-aka ọnụ ala karịa ibite ya n'ụlọ maka na ego ọmụrụ nwa nke mba ofesi na-aka ọnụ ala. Ọ sịkwa na ihe dịka ụlọọrụ 'International Monetary Funds (IMF) na-enye ihe dị ka afọ atọ tupu amalite ekwu ụgwọ e bitere ha ma kwụchaa ya n'afo ise ebitere ya bụ ego. Ọ sịkwa n' uru ọzọ dịkwa n'ibete ego na mba ofesi bụ na 'ọ ga-enyere gọọmenti aka ịkwalite dọla aga eji azụ ahịa nke ga-eme na ụkọ dọla agaghị adị, ọkachasị ugbua ahịa mmanụ agbidi danyụrụ anya. Mmanụ agbidi na-ada dọla iri abụọ. Nke a pụtara na ọ bere ihe na dọla iri atọ e ji mee bọjeti. Kedu ka ọ ga-esi emetuta ndị mmadụ? Uwaleke sị na ọ ga-emetuta ndị mmadụ n'ụzọ adịghị mma ma ọ bụrụ na gọọmenti etinyeghị ya bụ ego mbite n'ụzọ ọ ga-amịtara obodo ezi mkpụrụ dịka iji ya rụọ ụzọ, ọkụ, ụlọọgwụ na ndị ọzọ. Ọ si na gọọmenti tinye ego ndị a iji emezie ụmụ ihe ndị a eji enyere ndụ aka, na ụfụ ya bụ ego agaghị adị nke ukwu. Cheta na ego a na-ere mmanụ agbidi, bụ ihe Naịjirịa jiri hiwe isi malitere ịnyụ ka ọkụ kemgbe coronavirus bịara ụwa mgba nke bụ na ego e ji azụ ya bụ mmanụ erụghịzị isiego e ji arụpụta ya. Anyị lebakwara anya n'ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ya bụ ahịa mmanụ agbidi nyụọ ka ọkụ kpam kpam. Olee otu ọnụahịa mmanụ agbidi mbaụwa ga-esi metụta Naịjirịa? Ihe ahụbeghị mere n'ahịa mmanụ agbịdị n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Epreelu dịka udu mmanụ agbịdị nke mba Amerịka rere tọrọ. Ya bụ na n'Epreelu 20, 2020, ego mmanụ agbịdị dara ruo tọrọ -$00:35. Nke a pụtara na ihe mba Amerịka kwadoro ịre mmanụ agbidi ha kpọrọ West Texas Intermediate (WTI) n'ọnwa Mee ji ihe karịrị pasenti narị atọ (305%) sepụ ego n'ihe a na-ere ya. Ndị ọkachamara n'ahịa mmanụ agbidi sị na ihe na-eme n'ahịa ha emenụbeghị n'ụwa. Cheta Nwanze, onyeisi na SBM Intelligence, bụ ụlọọrụ na-eme nnyocha dị icheiche, kwuru na ""Ọ bụ ahụghị ebe a ga-anwụnye mmanụ amịpụtara butere ọdịda nke a."" Ọnụọgụgụ ndị ụlọ ọrụ Dow Jones sị na ụdị ihe ahụ emetubeghị kemgbe amalitere idetụ usoro azụmahịa mmanụ agbidi kemgbe 1983. Agbanyeghị na ndị otu OPEC + buturu mmanụ ha na-ebuputa na mbaụwa, ihe na-ebe ka na-ebe. Ndị International Energy Administration na-eche na mmanụ agbidi ha ga-ere n'ọnwa Epreelu ga-eji ihe karịrị udu mmanụ ruru nde iri abụọ na itoolu daruo ala maka agha Covid-19. Ya bụ agha mere na ndị mmadụ anaghị agagharị nke mere na azụmahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya kpụrụ afọ n'ala n'ụwa gbaa gburugburu ugbua. Ya mere ahịa mmanụ na ihe niile si na ya ji daa pịị. Ya bụ ọnwụ na-egbu nwankita abụghị taa ka ọ malitere. Kedụ ebe ọdịda oge mmanụ a malitere? O bidororii tupu Saụdị Arabịa na Rọshịa amalite agha mmanụa gbidi ha nụrụ n'ọnwa Maachi nke mere ha jiri jụ iso OPEC butuo mmanụ ha na-eresị mbaụwa. Nke a mere ka mmanụ agbidi gbọọ kasaa n'ahịa, mere ndị mba bụ ọkaibe n'ahịa mmanụ agbidi ji kwekọrịta ịwetulata aka na mmanụ ha na-ebupu na mbaụwa. Mana nke a akwụsịghị ihe ọbụla. Ihe na-ebe ka na-ebe. Kedụ ebe o si metụta Naịjirịa? Onye ọkachamara na-azụmahịa na ịchụnta ego bụ Christain Ezeagu kwuru na-egwu ga-adị ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi. ""Anyị ga-enwe nsogbu ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi maka na ọ bụ ebe ahụ ka anyị si enweta ego niile anyị nwere"". Ọ sị na Naịjirịa enweghị ụzọ ọzọ ha si akpata ego, ya mere ya bụ ajụjụ ji buru ajọ echiche nye Naịjirịa ugbua. Ọ sịkwa, ""Ndị na-azụ ahịa nkịtị agaghị ahụ ndị ga-ego ha ihe. Ohi na mpụ dị iche iche ga-amụbanwanye n'ododo"". Ọ bụ ego mmanụ agbịdị bụ na Naịjirịa na-emegharịnwu ahụ Patrick O. Okigbo nke atọ bụkwa onye aka ya dị na mmanụ agbịdị sị na oge Naịjirịa na-akpanwu ego ha ji ahazi bọọjetị ha ọnaghị arụpụtanwu ihe mmepe obodo. ""Ugbua ọ gaghị enwetenwu ego ọ ga-eji bulie bọọjetị ya, ị na-eche na o nwereike ịrụpụtanwu ihe mmepe obodo?"" Maazị Okigbo jụrụ. Ezeagu n'onwe ya gara n'ihu sị n'ọnwa abụọ gara aga, Naịjirịa na-eretezu Dọla dị ijeri narị naịra mgbe ha na ere otụ udu mmanụagbidi dọla iri ise maọbụ karịa. Mana ugbua, ego otu udu adarụọla anya rụọ dọla iri abụo na ise ebe ha jị dọla iri atọ mee bọjet ha. Ọ sị na e nwere olile anya na ihe ga-adị mma, mana ọ dịrị otua gawa, mara na-egwu ga-adị n'obodo. Odogwu ọzọ n'arukwa n'uloọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na-achọghị ka akpọọ aha ya si; ""ọbụrụ na Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi, Naịjirịa na ọtụtụ ụlọọrụ agaghị akwụlị ego ha bitere nke ga-ebute ịchụ ọtụtụ mmadụ n'ọrụ."" Maazị Nwanze tụrụ anya na amakaọjọ, atụru anya na ọnụahịa nwere ike ịgbagolite ruo dọla iri abụọ na abụọ n'onwa Juun. Ọ sị na ihe kpara ọdịda n'uche ya bụ na ndi mmadụ ji egwu azụ ya bụ ahịa. ""Ka a na-amalite iche maka WTI n'ụbọchị Tuzde, ego a ga-alịkwa,"" bu okwu Nwanze bịara na mezu n'ụtụtụ Tuzde dịka erere ya bụ mmanụ $13. Maka Naịjirịa, Nwanze si na ihe mere nwanza jiri ebe n'ọhịa ka nọkwa ebe ọ nọ. ""Usoro anyị si akpata ego anwụọla. Nke a pụtara na anyị kwesiri ihazigharị etu anyị ga-esi na-akpata ego maka emeghị nke a ga-ebute ezigbote nsogbu tupu afọ ise agacha."" Okwu a bụ nke ndị ọkachamara ndị ọzọ gbadoro ụkwụ na ya makana na anụ nwere otu mpụ na-anwụkarị ọsọsọ." afirika-48149205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48149205,Ebonyi Killings: Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Mgbo ma ndị aka ha dị ogbugbu mmadụ na Mgbo - Dave Umahi,Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti enyele ikike ka ndị uweojii nyochaa ndị niile ọnụ na eru n'okwu bụ ndị ọ na-ebo na ha ma maka ọgbaghara dara na Ngbo dị n'Okpuruọchịchị Ohaukwu na agbataobi ha bụ Agila nke Benue steeti.,"Gọv. Dave Umahi nke Ebonyi steeti Dịka Ọdeakwụkwọ mgbasa ozi ya siri kwuo ""Gọvanọ enyela ikike ka enyocha mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na okpuruọchịchị ahụ."" O teela aka ndị Ngbo n'Ebonyi steeti na ndị Agila nke Benue steeti zọwara ala. Nke a mechere ka gọmentị steeti abụọ ndị a hibechere kọmit udo atọ nke ga-ahụ na ya bụ ndọrọdọrọ ala bụ nke tagoro isi ọtụtụ mmadụ bụ ihe ga-abịa na ngwucha. Osote Gọvanọ ndị Benue bụ Benson Abounu na ogbo ya nke Ebonyi steeti bụ Kelechi Igwe hibere kọmiti a n'izu gara aga. Agbanyeghị nke a, ọgụ ka na aga n'ihu na obodo abụọ a bụ nke lagoro ọtụtụ ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ n'iyi. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Oda sị na ya enwetebeghị nke bụ eziokwu maka okwu a mgbe anyi dere akụkọ a. Akụkọ kọrọ na mmadụ anọ ndị a e gburu sọ na kọmiti udo . O nwebeghị onye ma ndị aka ha dị na ọchụ a egburu. Akụkọ ga-amasị gi" afirika-44530713,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44530713,Ihazigharị Naịjira ga-ebi nsogbu ya - Ohaneze,Nnia Nwodo kwukwara ka ndị Igbo bịakọta ọnụ ma dịrị n'udo dịka o kpọrọ oku ọhụrụ ka e lebara anya n'okwu gbasara ịhazigharị usoro ọchịchị Naịjirịa.,"Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Ọbụghị naanị Nwodo kwuru okwu, ndị so ya bụkwa ndị Igbo ndị ọzọ a ma ama dịka onye bụbu onyeisi ndị agha na Legos bụ Kọmọdọ Ebitu Ukiwe, Rear Admira Ndubuisi Kanu na ndị ọzọ. Ha kwuru okwu a oge a nabatara ndị isi ọhụrụ ohaneze Ndigbo na Legos steeti. Nwodo bere nwịị maka mmekpa ahụ a na-enye ndị igbo na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa maka etu usoro e ji achị Naịjirịa si dobe ya. N'okwu ya, ""ihe ga-egbo mkpa a maka kwụsị nsogbu Naịjirịa bụ ka e dozigharịa usoro ọchịchị ma ya bụ ebe ndị Igbo kwụ."" Cheta na ụlọ omeiwu Naịirịa akwadoghi ya bụ atụmatụ nchịgharị oge e butere ya ebe ahụ mgbe a chọrọ idegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa n'afọ gara aga." media-52450029,https://www.bbc.com/igbo/media-52450029,Workers' Day: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19,Agha ọbụla biara obodo ọbodo ọbụla nwere ndị nọ n'ihu ya.,"Ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị na-emeputa ihe nri , ndị ntakụkọ so n'ụfodụ ndị ọru a. Ọ dịghị fecha fecha mana ha ga na-anwa oke ha. Kedụ ihe ị ga-asị ha? Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo Akụkọ ndị ga-amasị gị:" akuko-ndi-ozo-42996985,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-42996985,Gọọmentị Anambara aghọpụtala ndị okpe udo,"Kọmishọna n'ahụ maka ikpe nkwụmọtọ n'Anambra steetị,Anali Chude, ahọpụtala ndị okpe udo ruru otu narị n' Anambara steetị.","Willie Obiano bidoro chiwa Anambra na 2014 Onye nkwuchite ọnụ mịnịstrị ahụ bụ Bernadette Nwadike sịrị na-ahọpụtara ndị a taa bụ thọsde, orie. Chude kwuru na ndị ahọpụtara bụ ụmụnwoke na nwaanyi na-enweghị ntụpọ n'agwa ha. Ọyọkwara ha ka ha kpezie ụdọ ma chekwa ikike onwe ndị Anambara nwere. O kwuru na ọrụ ha ga-abụ inara mmadụ n'aka ebe,idu iyi,iduga mmadụ ụlọ ndị uweojii nakwa ikpe udo n'obodo niile." egwuregwu-46165883,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46165883,Premier League: Ihe ndị Naịjirịa ritere n'asọmpi a,"Onweghi onye Naịjirịa ọbụla nyere goolu taa (bụ Satọde, ụbọchị nke iri nke ọnwa Nọvemba) n'asọmpi niile agbara n'egwuregwu Premier League.","Kelechi Iheanacho na ụmụnne ya na Premier League achịtaghị aja ọfụma Leon Balogun zuru ike n'oche ka ndị otu ya bụ Brighton natara ụtalị 2-1 n'aka ndị Cardiff City. Balogun adịghị ahụ bọọlụ gbaa kemgbe o si Jamanị gawa Ịngland. Isaac Success hụrụ bọọlụ gbaa mgbe Watford natara nhatanha 1-1 n'asọmpi ha na Southampton. Na Leicester City, Kelechi Iheanacho sọrọ mpi mana ha enweteghị mmeri n'asọmpi a ha ji kwanyere onye nwe ha nwụrụ na nso a ugwu. Iheanacho batara n'ime nkeji 60 na ya bụ asọmpi mana mbọ ya niile enyeghi Leicester mmeri. Ihe agbatara na Premier League ụbọchị Nọvemba 10 Cardiff City 2 - 1 Brighton & Hove Albion Huddersfield Town 1 - 1 West Ham United Leicester City 0 - 0 Burnley Newcastle United 2 - 1 AFC Bournemouth Southampton 1 - 1 Watford" afirika-45264572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45264572,Ọnụọgụgụ ndị ebola na-egbu na Congo ka na-arigo,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Ebola: Na Congo, ebola egbuola ihe ruru mmadụ iri ise na ise dịka ndị ọrụ ahụike ha si kwuo, Ebe ihe ruru mmadụ iri anwụọla na mba Italy ka idemmiri buuru ha na mpaghara Calabria. Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya ka o ji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita narị asatọ taa. O rituru sonye ndị ji ụkwụ na-aga maka na ndị na-akwado ya nọchichara ụzọ gbochiri ụgbọala ya igafe ka o si ebe ọ gara ekpere maka Sallah na-ala n'ụlọ ya na Daura. Ọganiihu ndị Aba Ndị na-arụ akpụkpọ ụkwu n'ahịa arịarịa dị n'Aba gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na e nye ha ohere, na ha ga-arụ akpụkpọ ụkwụ ndị Naịjirịa niile ga na-eyi. 'Arịarịa ga-arụkarị China ma ha nwee ohere' Ha kwukwara na ha chọrọ enyemaka gọọmentị inweta ngwaọrụ na ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ. N'egwuregwu, David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA. David Beckham gbara bọọlụ ihe ruru afọ 21 tupu ọ laa ezumike nka Beckham ga-enweta nturuugo onyeisi UEFA maka onyinye ọ nyere egwuregwu bọọlụ nakwa etu o si akwado bọọlụ n'akụkụ ụwa niile. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke na ndi na-achị ehi na-ebi n'udo. Akwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo" afirika-45236093,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45236093,Ọ dị mma di na nwunye inwe otu ọbaego n'ụlọakụ?,"Dịka di na nwunye na-emekọrịta ihe niile ọnụ dịka ịsa ahụ, i ri nri, i dinakọta n'otu akwa, ha o nwereike ikwe nwere otu ọbaego n'ụlọakụ?","Ajụjụ a ka BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị di na nwunye. Ụfọdụ kọwaara na ha anaghị eme chacha, ebe ndị ọzọ kwuru na ha mere tupu ha na-agba akwụkwụ alụm di na nwunye. Otu nwoke kwuru na nwunye ya nwereike i buru ego ha gbaa ọsọ, na ọ bụ ya mere ọ gaghị ekwe ka ha nwee otu ọbaego n'ụlọakụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49804087,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49804087,Fifa Best Player 2019: Messi bụ ọkacha agba bọọlụ n'ụwa,Lionel Messi e turula ugo dịka ọkacha agba bọọlụ na mba ụwa.,Nke a mere n'uhuruchi ụbọchị Mọnde n'emume 'Fifa Football Awards' e mere n'obodo Milan nke mba Itali. O meriri Cristiano Ronaldo nakwa Virgil van Dijk iji nweta nturuugo a. Ndị ọkacha agba (Ụmụ nwoke) Ndị ritere nzere ndị kacha agba bọọlụ n'ụwa gụnyere: Ndị ọkacha agba (Ụmụ nwanyị) afirika-46950392,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46950392,Obasanjo: Ị nwere ike zuo Naịjirịa niile ga-iru ma ọ bụrụ na ị bụ onye APC,"Na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere, onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bụbụ osote nakwa onye na-azo ọchịchị na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 bụ Atiku Abubakar.","Obasanjo: Ị nwere ike zuo Naịjirịa niile ga-iru ma ya bụrụ n'ịbụ onye APC O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC). Obasanjo kọwara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buahri ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapụ ikwado ndi ntoroọbịa n'ime mmadụ 73 na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa. O kwukwara ihe mere tupu ndị agha wakpo obodo Odi n'afọ 1999, bụ mgbe ihe ruru mmadụ 2500 ndị obodo nwụrụ n'aka ndị agha. Mkparịtaụka a ga-apụta n'uju eche bụ ụbọchị nke 22 nke ọnwa Janụwarị 2019." 42869283,https://www.bbc.com/igbo/42869283,Leicester City erela Ahmed Musa na mbinye,Onye na-agbara Leicester City bọọlụ bụ Ahmed Musa agafela otu CSKA Moscow na mbinye rue mgbe afọ egwuregwu ga-agwụ,Onye kpọbatara Ahmed Musa na Leicester bụ onyeisi Claudio Ranieri Nwafọ Naịjirịa dị afọ iri abụọ na ise bụ onye ndị leicester zụrụ n'ọnwa Julaị n'afọ 2016 n'ọnụ ego dị £16m. Ọgbalịrị ike ya ịpụta ihe na Leicester City ebe onyere nanị ọkpụ goolu ise n'asọmpi iri atọ na isii. Ndị CSKA Moscow kwuru na Musa ga-eso ha gba asọmpi ọdịnala ha n'akwa nke Europa. 45869728,https://www.bbc.com/igbo/45869728,IPOB: Ụmụ ntorobia a agaghị atụ vootu na 2019- Ugochukwu Uko,Ugochukwu-Uko kwuru na ọ bụ iwe etu ndi ọchịchị n'ala Igbo si akpa agwa na-ewe ha.,O kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu bụ sọ onwe ha na ezinaụlọ ha ka ha ma. O kwuru na mkpabụ ndị ọchịchị Naịjiria na-akpagbu ndị Igbo sokwa ewe ndị IPOB iwe. Gere ihe okwuru n'uju n'ihe nkiri dị n'akụkọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 45365199,https://www.bbc.com/igbo/45365199,"Theresa May alaala, Angela Merkel awụchie Naijiria","Ka ọ gachara abalị ole na ole Theresa May nke Briten bịara Naijiria, onyeisiala mba Jamini bụ Angela Merkel wụchiri Naijiria ụnyaahụ bụ Tọọsde.","A na-atụ anya na ọ ga-ezute ndịisi ụlọọrụ otu ECOWAS n'Abụja, nakwa onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari. Ha ga-enwe mkparịtaụka n'ihe gbasara nchekwa, azụmahịa, mbịambịa nakwa ntuliaka Naijiria na-abịa. Ndịisiala abụọ ahụ ga-akpa maka ịgbaga mba ọzọ, nchekwa, ntuliaka 2019 nakwa ihe gbasara ikwalite akụnaụba mba abụọ a. Njem Merkel n'ọdịda-anyanwụ Afrịka danyere oge e nwere ọtụtụ ngaghariiwe mebiri ihe megide ndị mbịarambịara si Afrịka n'ọwụwa-anyanwụ Jamini. Akụkọ ga-amasị gị" 52582416,https://www.bbc.com/igbo/52582416,Coronavirus Tips: Etu ị ga-esi mara ma ị nwere coronavirus,"Ọ bụrụ na ị hụ ihe ndị a n'ahụ gị, mara na ị ga-akpọtụrụ ndị ahụike ka ha gwa gị ihe ị ga eme.",Chetakwa na ọbụghị mmadụ niile nwere coronavirus n'ahụ ha ga-enwe ihe ngosi nke bekee kpọrọ 'symptoms'. Ya bụ cheta ka ị na-akpachapụrụ onwe gị anya site n'ịkwọcha aka gị oge niile nakwa izere mmekọ ahụ gị na ndị mmadụ. afirika-47672828,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47672828,Imo elections: Mmegharị ntụliaka na steeti ahụ ebirila ọkụ,"Ndị Ụlọ ọrụ INEC na steeti Imo e gosila nkwado ha banyere mmeghari ntụliaka eji ahọpụta ndị nnọchiteanya nke steeti n'ogbe dị iche iche bụ nke e hiwere echi bụ Satọdee.Okpuru ọchịchị ndị nke a metụtara gụnyere: Ikeduru, Isiala Mbano, Ngor-Okpala, Orsu, Isu, Orlu, Oguta nakwa okpuruọchịchị Njaba.","E yighariri ntụliaka a n'ihi ọgbaghara nakwa tigbuo zogbuo pụtara na ntụliaka mbụ e mere. Nkwado ụlọọrụ Inec pụtara ihie mgbe ha bagidere atụmatụ ikesa akụrụngwa ndị ahụ dịgasị mkpa eji eme ntụliaka taa. Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọ ọbaego ukwu CBN, a hutara na nkesa akụrụngwa a nọ aga n'ihu dịka o si kwesi. Ka osi dị, mbọ onye ọrụ anyị gbara ịmata etu ụlọọrụ a si akwado kụrụ afọ n'ala, dịka onu na-ekwuru ha na steeti Imo jụrụ ịza oku akpọrọ ya n'ekwe ntị.Mana onu na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo bụ Orlando Ikeokwu, kọwara njikere ndị uwe ojii dị iji nye ezi nchekwa na-ebe a ga-eme ntụliaka a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43616133,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43616133,Goolu abụọ Ibrahimovic nyere LA Galaxy mmeri,Zlatan Ibrahimovic ji ọkpụ goolu abụọ jiri mepo ọnọdụ na otu egwuregwu bọọlu LA Galaxy nke mba Amerịka bụ ebe ọnọzị ugbua.,"Ibrahimovic gbara ọtụ egwuregwu nke mba ya bụ Sweden bọọlụ, ma ruo ọrụ ka onye ndu ha Mpị a ndi LA Galaxy na ndị Los Angeles FC sọọrọ bu egwuregwu nke mbụ Ibrahimovic so ha agba. N'egwuregwu ahụ, Los Angeles FC ji ọkpụ goolu atọ na-aga Galaxy mana he mechara saa ha niile. Ibrahimovic, bụ onye dị afọ 36, nyere gollu abụọ na ya bụ asọmpị, otu n'ime ha bu nke o ji isi nye na ngwucha. Ibrahimovic sị; ""a nụrụ m ka ndi mmadu na eti 'Anyi chọrọ Zlatan, anyi chọrọ zlatan."" ""Ya mere m jiri nye ha Zlatan. Ha na-akwa m, m na-enyechi ha,"" Onye egwu a kwuru ka agbachara ya bu asọmpị. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43578266,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43578266,Gịnị mere ọtụtụ ndị Igbo anaghị eme ntụlịaka?,"N'ụbọchị Maachị 28, Maazị Ugo Egbujo na Odoziaku Nnenna Okoronkwo bụ onye INEC nwere mkparịtaụka na Facebook Live anyị.","Kedụ otu ntụlịaka siri dị mkpa? Ha kpara maka ihe mere ọtụtụ ndị Igbo achọghị ime ntụlịaka site na inweta akwụkwọ ha ga-eji mee ntụlịaka a na-abịa n'ihu. Lee ka o si gaa. Content is not available End of Facebook post, 1 Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49869001,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49869001,Independence day Nigeria : Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ - Trump,Trump ekelela Buhari na Naịjirịa,"Akụkọ dị mkpa: Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump eziterela onyeisiala Muhammadu Buhari ekele ọma maka ncheta ụbọchị nnwereonwe Naịjirịa bụ ụbọchị mbụ ọnwa Ọktoba. N'ozi ya, Trump sị na Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dịnta abụọ na-achụ otu anụ ọhịa n'ụzọ dị iche iche. Ọ sị na Naịjirịa na Amerịka bụ enyi n'ibu agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa dịka Boko Haram, ISIS na ndị ọzọ. Trump sị na mba Amerịka dị njikere ịnabata atụmatụ ọchịchị Buhari n'ụzọ ga-enye aka iwulite mba abụọ ndị a. Ọgbaaghara dara n'ụlọomeiwu ndị Bayelsa Ụda egbe na ọgbaaghara bụ ihe e ji gbasaa nzuko ndị ụlọomeiwu Bayelsa Steeti mere dịka ndị omekaome gbabatara n'ụlọomeiwu ahụ. Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị omeiwu chọrọ ịchụtu onyeisi ha bụ Tonye Isenah , onye a sịrị chọrọ ịgba arụkwaghịm. N'egwuregwu Manchester United ga-ele ndị Arsenal ọbịa n'Old Trafford n'asọmpi Premier League nke abalị a. Ndị ọgba bọọlụ dịka Anthony Martial, Marcus Rashford, Alexandre Lacazette agaghị agba n'ihi mmerụ ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Agbagbuola onye uweojii n'Abia Steeti Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Ndị uweojii nọ n'Aba ekwuola na ha ka na-enyocha ka ha mara etu ndị ogbe ezu si gbuo onye otu ha. Akụkọ pụtara n'ụbọchị Sepụtemba iri abụọ na asaa kwuru ndị oji egbe ezu wakporo ndị uweojii atọ na-eme nchekwa ngagharị gbuo otu,meruọ otu ahụ ebe onye nke atọ gbalagara. Ndị oji egbe ezu ahụ jịkwa egbe ndị uweojii ahụ gbalaga. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ya bu ihe mere mana ha ka na-enyocha ka ha mara ka mmiri si baa n'opi ugbogiri. Anyị ga-ewetere ụnụ nchọpụta ha n'uju dịka ha kwere na nkwa ịgwa anyị ma ha mecha. Ihe DSS mere Chido Onumah Ụlọọrụ Department of State Services (DSS) akọwala na onweghi mgbe ha ji nwụchi Chido Onumah bụ onye ntaakụkọ na-akatọ ọchịchị ọjọọ ma kwuo na ọ bụ ịtụziri ya aka ka ha mere. Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba a bụ Peter Afunanya kwuru na ọ bụ n'ihi efe o yi edere ""anyị niile bụ Biafra"" na ya bụ ihe kpatara okwu a. Cheta na aakụkọ pụtara ụnayhụ na ndị DSS nwuchiri ya bụ nwamadi ụnyahụ ka ọ 'tụrụ down' n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe International airport dị n'Abuja. Ha mechara wepụta akwụkwọ ozi gosiri na ọ bụ mkparịtaụka ga-eme ka akwa Onumah ghara ibutere ya nsogwu nakwa ụmụ Naịjirịa. Ha kwuru na ụlọọrụ ha na-eme ihe ọbụla iji hụ na ha adaghị iwu Naịjirịa. E nwere m olileanya na Naịjirịa ọhụrụ Osote onyeisiala Naịjirịa Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na na-agbanyeghị nsogwu niile Naịjirịa na-enwe , o nwere okwukwe maka Naịjirịa ọhụrụ ga ha pụta. O kwuru nke a n'ụka a akara ụnyahụ iji malite emume ụbọchị ncheta nwereonwe nke Naịjirịa nke ugboro iri ise na itoolu. Ide mmiri ataala isi mmadụ otu narị Ihe karịrị mmadụ narị anwụọla na mba India n'ihi oke ide mmiri na steeti Uttar Pradesh nakwa Bihar. Ihe ndị ọzọ ide mmiri a metụtara bụ njem ụgbọala, ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ, ị ga ụlọakwụkwọ nakwa ọkụ latrik. N'egwuregwu, N'egwuregwu, Minista na-ahụ maka egwuregwu na mwulite ndị ntorobia bụ Sunday Dare enyela iwu ka akpọghachi onye na-elekọta ndị ọgbọsọ Naịjirịa bụ Sunday Adeleye. Ọ bụ n'ihi emetaghị ọrụ ya ọfụma nakwa ịda iwu IAAF ka eji kpọghachi Adeleye. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo?" media-55683016,https://www.bbc.com/igbo/media-55683016,Igbo History: Ihe mere ndị bekee enweghi ike ịchọta Ivin Ukpabi ndị Arochukwu,"Aha ya abụghị Ibin Ukpabi, aha ya bụ Ivin Ukpabi.","Ndị ọcha chere na ọ nọ otu ebe ha amaghị na a na-ebụgharị ya ebugharị. Ndị ọcha chọgidere ya mana ha ahụtaghị ya, ya mere ha ji ekwu ""The Juju too long""." 45663091,https://www.bbc.com/igbo/45663091,Ndị Abịa: Gọọmentị bịa doziere anyị okporoụzọ Okigwe-Umuahia gbabiri abụọ,Ndị njem nakwa ndị obodo gbara Isikwuato gburugburu ebekuola goomenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ụzọ nke abụọ si Okigwe gawa Enugwu gbabiri abụọ n'obodo Akara dị n'Abịa steeti.,"Ndị Abịa: Gọọmentị etiti bịa doziere anyị ụzọ Okigwe-Umuahia gbabiri abụọ Ọdachi a mere na nsonso dịka oke mmiri ozuzo butere oke idemmiri kpara mkpamkpa n'ebe ahụ. Otu onye obodo ahu bu Joseph Odinuko gwara BBC na o bu oke mmiri ozuzu nakwa elezighị anya butere mgbabi okporoụzọ ahu a mara dika 'ABSU-Akara Road' ""Kemgbe Ochichi Ndubisi Kalu, o nweghi ihe obula e mere n'ụzọ a."" Na nkọwa ya, otu onyeisi na ministri na-ahu maka gburugburu n' Abia state bu Thomas Okoro kwuru na odachi ahu karịrị goomenti steeti ahu aka. Na nsonso a, oke idemmiri so mmiri ozuzu emebiela ọtụtụ ihe n'obodo dị iche iche na steeti dị na mpgahara ọwụwa anyanwụ gunyere Anambara nakwa Abịa steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48681614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48681614,"Suspension of 27 LG Chairmen: ""Emeka Ihedioha anaghị abọ ọbụbọ""",Gọọmentị Imo steeti apụtala ịzara ọnụ ha gbasara ndị okpuruọchịchị 27 a kwụsịtụrụ ọrụ n'Imo steeti taa.,"Ndị ọ gbasara gụnyere ndịisioche okpuruọchịchị, ndịisi ngalaba gọọmentị na ndị ọrụ enyemaka gọọmentị ndị ọzọ. Ọnụ na-eckwuchitere Emeka Ihedioha bụ Chibuike Onyeukwu kwuru na eleghi anya pati n'ihe mere taa. N'ọnụ ya ""Ọ bụ maka ebubo ụfọdụ eboro ndị a ka ndị nzụkọ omeiwu ochie jiri manye ya bụ iwu"" O kwukwara na a ga-eme nyocha ọfụma tupu a mara ihe a ga-eme ndị a akwụsịrị ọrụ n'ike. ""Mkpa Ihedioha bụ ileanya n'ihu na ịdozi Imo steeti n'abụghị ileghachi anya n'azụ"" ka ọ gwara BBC. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43525077,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43525077,"IGR: Anambra, Akwa-Ibom so na steeti pekarịrị","Ego steeti iri atọ na otu nwetara n'onwe ha ke a kpọrọ 'internally generated revenue(IGR)' na bekee, ji pasentị 12 gbalitere n' afọ 2017, ebe ego steeti ise gụnyere Anambra, Akwa-Ibom , Osun na Taraba kụrụ afọ n'ala n'ihe gbasara ego steeti ọbụla na-akpata n'onwe ya n'afọ.","Naịjiria apụtala na Riseshọn Ngalaba na-ahụ maka ọgụọgụgụ nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics (NBS)', kwuru nke a n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraide sịrị na ego nke ndị steeti nwetara n'afọ 2017gbalitere rue N931.23bn, ebe ọ bụ N831.19bn afọ bụ ya ụzọ, nke naegosi ndịiche N100.04bn. NBS kwukwara na e nwetara N432/65bn na ọkara abụọ nke afọ 2017(H2 2017), ebe N409.09bn bụ ihe e nwetara n'ọkara mbụ nke afọ ahụ. Ego nke gọọmenti etiti nwetara n'afọ bụ triliọn N1.73 ebe steeti ketara triliọn N2.67. Mana ụgwọ eji ndị mba ofesi kwụ na ijeri dọla 19.9, ebe ụgwọ ejị na ụlọ bụ trịliọn N3.35 ka afọ 2017 kwụchara. Akụkọ ga-amasị gị: A tụọla nwaanyị nga maka igbu ụmụ ise" afirika-50066186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50066186,World Food Day: Mama dị afọ 104 ji ọrụugbo zụọ ụmụ ya,Mama nnukwu Jessie Onuigwe bụ onye ọrụugbo si n'obodo Akabọ Osumenyi dị n'Anambra Steeti kọwara etu o ji were ọrụugbo zụọ ụmụ ya anọ.,Ọ sị na ọ bụ ọrụugbo a mere ahụ ji sie ya ezigbo ike dịka ọ nọ afọ otu narị na anọ ugbua. Mama Jessie sị na ọ mụrụ ụmụ anọ na ụmụụmụ otu narị na iri abụọ na anọ. O kwuru na ọ bụ ịkọ ugbo ka o ji malite ụwa bụ nke nyere ya ego o ji zụọ ụmụ ya. Ada ya nwaanyị bụ Patience Uzoma Oguine dị afọ iri asaa na asatọ sị na di mama Jessie bụ nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere. Na ọ bụ mama zụpụtara ha ruo mgbe ha tolitere lụọ dị. Ọ sị na a mụrụ mama Jessie Onuigwe n'afọ 1915. Mama Jessie gara n'ihu kwuo na ọ bụ iri nri Ndigbo na ikpere 'Jesus' mere o ji gbasie ike. Kirie ihe o kwuru n'uju. Akụkọ ga-amasị gị afirika-46054505,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46054505,Akụkọ dị mkpa taa: PDP adọola Tinubu aka na ntị gbasara ihe o kwuru maka Atiku,Akụkọ ndị dị mkpa N'etiti PDP na Tinubu,"Otu PDP adọọla otu isi ahụrụ kwaba okpu ndị APC bụ Ahmed Bola Tinubu aka na ntị ka ọ ghara ịchịpụta onwe ya ụkwụ n'ama site n'ikwu okwu dị an̄aa banyere onye nke ha na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar. Nke a na-abịa ka Tinubu kwuru sị na ebe ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ ha na-ezute Atiku, na ọ ga-ada ma kwukwaa na APC anaghị atụ ya ụjọ. Mwakpo Boko Haram Ndị agha nkịtị na-enyere ndị agha Naịjirịa aka ịlụ ọgụ na mpaghara ugwu-ọwụwaanyanwụ Naịjirịa kwuru na ndị agha nnupuisi Boko Haram wakporo ndị mmadụ na Borno steeti n'abalị ma gbuo ihe ruru iri na ise. Dịka akụkọ si kwuo, ha wakporo obodo Bulaburin na Kofa nakwa Dalori ebe ha zuru ha ohi ma mụnye obodo ahụ ọkụ. Na mba ofesi, Kanada na-anabata ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ndụ Kanada na-achọ ịgbara ndị Naịjirịa na-ejighi akwụkwọ ikike bata mba ha ụgbọ nwamkpi. N'agbanyeghị na ọ bụghi naanị ndị Naịjirịa ka nchụla a metụtara, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ ga-aka metụta makana ndị Naịjirịa karịchara na ndị na-ejighị akwụkwọ nọrọ na Kanada. N'egwuregwu, A ga-ebido emume ili onye nwe otu Leicester City nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'abalị Satọde gara aga n'Ịngland. Vichai Srivaddhanaprabha zụtara otu egwuregwu Leicester City n'afọ 2010 A ga-eme emume ili ya rue ụbọchị asaa na mba ebe o si bụ Taịland. Gere akụkọ niile a n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Achọtala ozu Alkali Ndịagha Naịjirịa achọpụtala ozu otu onye ndu ha bụ Mohammed Idris Alkali furu efu kemgbe ọnwa Sepụtemba. Ndịagha ahụ kwuru na ọ bụ otu onye echere so na ndị gburu ya kpọgara ha n'ebe achọtara ozu nwoke ahụ. Ọzọ, Uche Nwosu bụ onyeisi ndị ọrụ na Imo steeti Rochas okorocha, Uche Nwosu nakwa ndị otu ha ndị ọzọ emeela ngagharị iwe n'Owerri maka ihe ha kpọrọ mkpagbu n'aka ndị isi otu APC Nke a na-abịa dịka a na-anụ kepu kepu na Okorocha nwereike ịgbalahụ otu APC fere pati ọzọ maka okwu ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu. Na mba ofesi Ndị na-eme nyocha n'ụgbọelu Lion Air dara ada achọtala akpati ojii na-edekọ ihe niile mere n'ime ụgbọelu ahụ tupu ọ daa. Rue ugbua, achọpụtabeghị onye ọbụla ma haadị ndụ ma ha anwụrụ anwụ n'ihe mberede ahụ. N'eguwregwu, Otụ ọgba bọọlụ Naịjirịa nwere ọrụsị apụọla n'asọmpị iko mba ụwa nke ndị nwere ọrụsị na Mexico. Ha pụrụ n'agbanyeghị na ha meriri mba El- Savador n'ihe bụ asọmpị iko mba ụwa nke mbụ ha. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44012346,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44012346,Akụkọ kachasị na mgbede a: Mee 30 bụ ụbọchị ncheta Biafra,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Ipob kpọrọ okụ ka a nọrọ n'ụlọ na Mee 30 30 Mee bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Biafra Ebe Zionists Movement na-akpọ oru na Igbo ka ha lọta n'uju maka ncheta Biafra, Ipob akpọkuola Igbo ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee maka ncheta ndị egburu egbu n'agha Biafra. Onye mgbasaozi ndị Ipob bụ Emma Powerful, bụ onye kpọkuru ndị ọbụla nwere mkpagbu na Naịjirịa ka ha soro na ya bụ ntukwu n'ụlọ nke iwe. Ndị uweoji emeela ngagharị iwe n'Abuja taa. Ndị uweojii anaghị agba akabe abụbụ ọrụ a Iwe ha bụ na ha aghọtaghị ebe isiakwa dị a dị gbasara ụgwọ ọnwa ha dịka otu onye n'ime ha na-achọghị ka a kpọọ aha ya siri kwuo. Ebugala Dino Melaye ụlọọgwu n'Abuja Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino Ozị rutere BBC ntị ugbua na-ekwu na a hapụla Dino Melaye n'akaebe maka ịga ụlọọgwụ. Justice Ajanah Nasir bụ onye ọkaikpe ukwu, nyere ikike ka e buru Melaye gaa ụlọọgwụ Abuja maka ịzọ ndụ ya. N'egwuruegwu, Manchester United na Brighton Ndị Manchester United na Brighton ga-akwakọrịta mpi n'elekere asatọ nke abalị a. Nkeji nke abalị a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Ihe onyonyo ndị NURTW wakporo ndị ọrụ n'Agege Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-47432169,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47432169,2019 Elections: APC Imo steeti chọrọ ikwatu Oshiomhole,Akukọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a,"APC Imo juru Ịgbanye mkpachapụ Rochas APC Imo steeti nọ n'ọgbaaghara kemgbe afọ gara aga APC Imo steeti akpọọla oku ka achụpụ Adams Oshiomhole dịka onyeisi pati ha mana ekwusi ike na mkpachapụ ahụ akpachapụrụ Okorocha enweghị isi maọlị. Onyeisioche Pati ahụ na Imo steeti bụ Daniel Nwafor gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Satọde na Onyeisi Pati ahụ bụ Adams Oshiohmole erubeghiri ụlọikpe isi maka okwu ahụ, nihi ya na ha agaghị ekwenya na ya bụ mkpachapụ. SERAP Akpụpụla Gọọmenti ụlọikpe SERAP gbara Gọọmenti etiti akwụkwọ Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) Akpụpụla gọọmenti etiti na nke steeti ụlọikpe nke ECOWAS dị n'Abuja maka iji nke Bekee kpọrọ Cyber Crime Act megide, jide maọbụ kpọchie ndị ntaakụkọ maka ikwu uche ha. SERAP sị na ya bụ agwa gọọmentị na-akpa megidere ikike dịrị onye ịkwu uche ya na obodo Naịjirịa. Ngagharịiwe na Algeria Ngagharịiwe Algeria N'ofesi, ụmụakwụkwọ mahadum n'Algeria apụtala ngagharị iwe ịmegide echiche onyeisiala ha bụ Abdelaziz Bouteflika ịtinye akwụkwọ ịso zọọ ọkwa ọnyeisiala nke ụgboro ise. Bouteflika bụ onye gbara afọ iri asatọ na abụọ (82) kwuru nke a n'ọnwa gara aga bụ nke kpaliri iwe na ọnụma ndị mmadụ na mba ahụ. Chelsea 2 - 1 Fullham Chelea ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Fulham N'egwuruegwu e Watford ewerela ọkpụ abụọ asatara otu merie Leicester (2 - 1) na. Ebe Chelsea ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Fulhma. Gee nkeji anyi ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị ọkaiwu Atiku adịla njikere Dịka okwu siri kwụrụ ugbua, Atiku Abụbakar sị na na ya ehiwela otu iwu ma nye ha ikike iweghachị oke ọ sị ruru ya ezuru ezu Cheta na Maazị Abubakar bụ onye ji aha pati PDP zọọ ọkwa onyeisiala. Agbanyeghi na ọtụtụ mmadụ isi ha gbagotere na Naịjirịa nakwa mba ofesi dị iche iche na-akwado ntuliaka, Abubakar na ọ na-ehiwe ndị ọkaiwu ga-ama aka mmeri Buhari meriri ya n'ụlọikpe. Egbuola mmadụ ọzọ na Kaduna Nasir el-Rufai rụbụrụ ọrụ ka Minista ha ahụ maka Abuja Ogbugbu mmadụ ka bụkwa ihe a kpụ n'ọnụ na Kaduna steeti ebe ndị oji egbe aga gbagburu mmadụ isii ma merụọ mmadụ asatọ ọzọ ahụ. Nke a mere ụbọchị Satọde n'obodo Sabon Sara dị nso na obodo Kidandan n'ọchịchị ime obodo Giwa, dịka ndị ntọọ chọrọ ịtọrọ mmadụ. Ndị na-akatọ oke agbụrụ n'Italị Ọtụtụ igwe mmadụ gbakọtara n'obodo Milan nke mba Ịtali ma mee ngagharịiwe megide ịkpa oke agbụrụ Nke a bụ iji katọọ iwu gọọmentị ha nyere nke gụnyere ịgbara ndị mbịarambịa ụgbọ nwamkpị ma ọ bụrụ ha mee ihe ọjọọ. Barca tụrụ Madrid ọkpọ n'isi Barcelona egosila Real Madrid nkarị n'oge a site n'imeri ha ugboro abụọ n'ime ụbọchị anọ. Barca ji otu ọkpụ goolu merie Madrid n'asọmpi El Classico ha gbara n'abalị ụnyaahụ. Gee nkeji a n'uju ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyi nke taa: Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere" afirika-52978861,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52978861,'Etu nwa anyị nwaanyị si bilie n'ọnwụ',Nwa bụ ngozi Chineke na-enye ezinaụlọ ọbụla mana ọ dịka ọmụmụ Osinachi achọrọ ịghọrọ ekike ọjọọ.,Nke ahụ bidoro mgbe a mụrụ nwa ahụ mgbe ọ fọrọ ọnwa anọ tupu ọ nozue n'ime afọ. Lee ihe onyonyo a ka ị hụ etu ihe siri tụgharịala ezinaụlọ John Uwakwe nakwa ihe mere nwa ha nwaanyị n'ikpeazụ. Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị 43095862,https://www.bbc.com/igbo/43095862,"Na Borno, ogbunigwe egbuola ihe karịrị mmadụ 17",Ndị oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe abụọ egbuola ihe karịrị mmadụ iri na asaa ma merụọ iri ise ahụ n'ime otu ahịa n'obodo Konduga dị na Borno steeti.,"Ha wakporo ahịa azụ na-ekwo ekwo n'obodo Konduga nke dị nso na ndịda Maiduguri. Ndị hụrụ ka o si mee kwuru na mkpamkpa a dị ezigbo egwu, ebe ndị ọrụ gbatagbata na Borno steeti kwuru sị na ndị mgbagbuonwe abụọ ahụ sokwa na ndị nwụrụ. Is'haq Khalid bụ onye ntaakụkọ BBC na-akọwa na na-agbanyeghị na onwebeghị onye kwuru na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a, ka o siri mee na-arụ aka na ọ bụ akaọrụ ndị Boko Haram na-enye nsogbu na mpaghara ahụ. Ebugala ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ." afirika-45294742,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45294742,Ọghọm karịrị uru dị n'ịṅụ mmanya,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Egwu Eke nke atọ onye ka a na-akụrụ ya? Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo akatọọla amụmụa Egwu Eke nke atọ gọọmentị chọrọ ibido na mpaghara ahụ. Ha sị na ewere ego a chọrọ iji gba ya bụ Egwu Eke tinye n'ọrụ n'akụkọ ebe ndị ọzọ a na-enwe ọgbaaghara na Naịjirịa na udo ga-alohachite. Ehibela Kọmiti ga-ahụ maka ahụike na Ọwụwa Anyanwụ Naijiria Ehiwela kọmiti ga-ahụ maka ahuike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ South East Consultative Committee on Health. Gọvano Ifeanyi Ugwuanyi bụ onye hibere n'aha ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ụnyaahụ Tọọsde kwuru na ọrụ ha gụnyere ikpokota na ịgbasa ozi ahụike n'ime obodo nakwa iwepụta ụzọ a ga esi mee ka ọrụ ahụike kwuru chim na mpaghara ahụ. Na mba ofesi, Onye nchikọta otu biafra a kpọrọ BIM akpọọla oku ka ụmụ Igbo dum bido ikwu ụtụisi na ụlọọrụ ha dị gị nso maka nwereonwe Biafra. Ozị a dị na akwụkwọ Ralph Uwazuruike zigara ndị ntaaakụkọ na Tọọsde. Ndí na-aṅụ mmaya Ndị ọkamụta enyopụta na ọghọm dị na ịṅụ mmanya kariri uru ya. Nke a dị n'akwụkwọ nchọpụta ha mewere kemgbe afọ iri abụọ na isii (26) bụ ebe ha chọpụtara na mmanya nwere ike ịbute ọrịa kansa. N'egwuregwu, Ọzọ dịka ibe ya anwuchiela ihe ruru mmadụ puku bụ ndị asịrị ṅụrụ mmanya bịa ikiri egwuruegwu bọọlụ ndị Burnley na Olympico na Greece. Amakanyere otu onye bịara ikiri asọmpi bụ otu n'ime onye kwadọ ndị Burnley mma n'asọmpi ahụ nke e meriri ndị Burnely. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye" afirika-51666990,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51666990,Fr Mbaka: 'Ọchịchị Jonathan chiri 'insecurity' Igwe na Naịjirịa ',"Ụkọchukwu Katọlik na-elekọta ụlọekpere 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu, bụ Ejike Mbaka ekwuola na ọbụghị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari kpatara ọnọdụ nchekwa ji akawanye njọ na Naịjirịa.","Mbaka kwuru na ọ bụ mgbe Goodluck Jonathan bụ onyeisiala ka ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-achị dịka eze. O kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde oge ọ na-aka ụka ntụ. Cheta na ndị ụka Katọlik niile wepụtara ụbọchị Wenezde iji yie akwa ojii ma ruo ụjụ maka oke ọbara ndị omekome na-akwafu na Naịjirịa. Ndị Katọlik mekwara ngagharị ekpere n'Enugwu n'ụbọchị Wenezde maka ihi nke a. Bishọp Enugwu bụ Callistus Onaga sokwa yiri akwa ojii oge e mere ngagharị ekpere ahụ. Fada Mbaka na-egbu nwaanyị ntụ Mbaka kwuru sị: ""Tupu Jonathan na-abata, 'insecurity' ebidogo."" ""Jonathan wee bazie ya eze, kpunye ya okpu, (tupu) Buhari rịbatazie na ya."" ""Mgbe e chiri (nchekwa ọjọọ) igwe bụ mgbe Jonathan, Buhari dị nnọọ ka Onowu. Ọ Jonathan ha bụ Igwe."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" 46738348,https://www.bbc.com/igbo/46738348,Christian Pulisic: Ị matala ego ole Chelsea zụrụ onye egwu bọọlụ a?,Onye egwu bọọlụ bụ Christian Pulisic agalaa Chelsea ka a zụchara ya £58 million (€64m/$73m).,"Chelsea ga-agbazinyeghachi ya otu egwu Dortmund ruo n'ọgwụgwụ oge 2018-19. Nwa amala mba Amerịka kpara ike ka ọ wachara ka ọnwa n'oge 2015-2016. Site n'oge ahụ, ọgbaala ndị otu ya bụ Dortmund ugboro 115 na Bundesliga, ebe o nyere goolu 15 ma mepụta ohere inye goolu 24. Mana ọ na-adọlị n'akụkụ otu Lucien Favre ndị gbaaliterela n'elu Bundesliga, ma ka Bayern Munich ghara ị na-ahụ azụ ha anya. ." afirika-50401439,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50401439,Enyinnaya Abaribe: Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe,"Senetọ Enyinna ya Abaribe etiela mkpu maka ihe ọ kpọrọ ""kpachi ndị mmadụ ikwu uche ha na Naijiria.""","Ikike onyekwuouche ya na-akawanye njọ ugbua - Abaribe Abaribe, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde n'ihe gbasara iwu 'social media' na iwu 'Hate Speech', gbadoro ụkwụ na nwụchi a nwụchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ, na ndị kwuru uche ha maka ihe na-aga n'obodo. Dịka Abaribe kwuru na ya maghị n'uju ihe dị n'iwu 'Social media' na iwu 'Hate speech' n'uju, gara n'ihu gwaa ndị na-akpa nkata ime iwu a ka ha saa anya mmiri. Abaribe onye gụpụtara ọtụtụ okwu Lai Mohammed kwuru n'oge ọchịchị Jonathan sịrị na : ""Ọ bụrụ na iwu 'hate speech kwuru ka akwụgbuo onye dara ya di ire n'afọ 2012 rue 2015 oge Lai Mohammed na-ekwu ụdị okwu ọjọọ ndịa maka Jonathan, Lai Mohammed ọ kara adị ndụ ugbua?"" Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọsịsa Lai Mohammed nye okwu a Abaribe kwuru, mana ọ zaghị ekwentị ya. Kogi state: Ụlọomeiwu ukwu ekwela ka e binye Kogi steeti nde iri Dịka Kogi steeti na-akwado maka ntuliaka gọvanọ n'oge na-adịghị anya, ụlọomeiwu ukwu ekwenyela ka e binye ha ego.. Ụlọomeiwu ukwu akwadola arịrịọ onyeisiala Muhammadu Buharị rịọrọ ka e binye Kogi State ijeri naịra iri ka ha were kwụọ ụgwọ ha jigasị. Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-atamu na ego ahụ nwere ike ịghọ ihe ndị APC ga-eji zụọ vootu na steeti ahụ na ntuliaka a ga-eme n'oge na-adịghị anya. Ọnwụ ezutela ndị uweojii Ndị omekome agbagbuola ndị uweojii abụọ na Kaduna steeti dịka Ali Ali Janga bụ kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ si kwuo. Cheta na akụkọ kwuru na a gbagburu ndị uweojii abụọ na Bayelsa ụbọchị Tuuzde. David Villa achịliela akpụkpọụkwụ ya Nwaokorọbịa gbabuuru otu Barcelona nakwa mba Spen bọọlụ aha ya bụ David Villa alaala ezumike nka. Villa, onye nọ Japan agba bọọlụ ugbua, kwuru na ya ga-awụsa ọwa n'ọnwa Disemba mgbe afọ bọọlụ nke mba Japan ga-abịa n'isi njedebe. Gịnị na-esere Obaseki na Oshiomhole? Esemokwu dị n'etiti gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki na nna ya ukwu bụ Adams Oshiomhole agafewela ọgụ nne na-agbara nwa ya. Otu jikọrọ ndị gọvanọ APC akwanyela Oshiomhole ọkụ n'ike ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu maọbụ kwara ngwongwo ya rituo. Oshiomhole na Obaseki Dịka ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na-erute nso na Edo State, esemokwu dị n'etiti gọvanọ Obaseki na Oshiomhole na-akawanye njọ. Esomokwu a etisaala pati APC ụzọ abụọ, otu ụzọ na-ekwu na ha achụpụla Oshiomhole na pati ha. Mana otu ndị nke ọzọ kwuru na ọbụ Obaseki ka ha chọrọ ka o si na APC pụọrọ ha. O nwebeghị onye ma nke bụ nke. Esemokwu Oshiomhole na Obaseki pụtara ihe n'ọnwa Juun. N'oge ahụ ka onyeisi ọkaikpe nke Edo Steeti ji abalị wee duo ndị omeiwu steeti ahụ n'iyi ọrụ. N'ime mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ, naanị mmadụ itoolu ka e duru n'iyi ọrụ n'oge ahụ. Akụkọ kọrọ na ndị ahụ e duru n'iyi ọrụ bụ ndị na-akwado Obaseki ebe ndị ọzọ bụ ndị otu Oshiomhole. Ikpe ọnwụ ọ na-eche onye kwuru okwu asị? Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye wepụtara iwu ọhụrụ a Akụkọ gbasara iwu ọhụrụ ndị ụlọomeiwu ukwu na-atule iji gbochie okwu asị ka na-akpọtụ n'elu n'ala Naịjirịa. Onye wepụtara iwu a bụ Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye ji ọkwa Chief Whip. Ihe kpatara iwu ọhụrụ ji ewu ewu bụ na ndị mmadụ kwuru na e nwere ike iji ụdọ kwụgbuo onye a mara ikpe maka ikwu okwu asị. Ntaramahụhụ ndị ọzọ gunyere ịtụ onye dị otu ahụ mkpọrọ ndụ ha niile maọbụ ogologo afọ. Iwu ahụ kwukwara ka e kewapụta ngalaba ga na-ahụ maka mgbochi ikwu okwu asị. Cheta na Aliyu Sabi wepụtaburu iwu a n'afọ 2018 mana ọ gafeghị. Nke a mere ka o wepụtakwa ya ọzọ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tuzde. Mana ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu. Moghalu Kingsley kwuru na iwu ahụ kwesịrị ka a kwụgbuo ya. Shehu Sanị kwuru na iwu ahụ gosiri aka ike ndị nọ n'ọchịchị. Onye ọzọ kwuru na iwu ahụ n'onwe ya bụ okwu asị. Ihe Atiku kwuru Atiku Abubakar Onye bụbu osote onyeisiala Naịjịrịa bụ Atiku Abubakar gwara ndị ụlọomeiwu Senate ka ha gbara ọgwụ ha ṅụọ gbasara iwu ọhụrụ a. Atiku kwuru na iwu ahụ ga-emegide ikike nkwuwa okwu bụ nke Bekee pkọrọ 'Freedom of speech'. O kwukwara na ọ dị ọtụtụ ihe na-emebi emebi na Naịjirịa bụ nke ndị omeiwu kwesịrị ileba anya. A ga-amachi ịrịọ arịrịọ na Borno Ndị arịrịọ Ekeresimesi bidoro nnọọ n'oge maka ndị arịrịọ bị na Borno State. Gọvanọ ha bụ Babagana Umara ji puku naịra iri atọ gbachaa ha niile ahụ n'otu n'otu. Govanọ Babagana Umara Ihe ruru mmadụ puku asaa ketara ego a. Mana gọọmentị kwuru na onyinye ahụ bụ iji kwadoo ha maka mmachi ịrịọ arịrịọ bụ nke a ga amalite n'oge na-adịghị anya. Na Bolivia Jeanine Áñez ji aka ya mee onwe ya onyeisiala, ụlọikpe kwadoro ya Nwanyị onye omeiwu na mba Bolivia aha ya bụ Jeanine Anez ejirila aka ya mee onwe ya onyeisiala dịka onyeisiala Evo Morales gbachara arụkwaghị m. Anez kwuru na dịka iwu obodo sị dị, ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ka o ruru n'aka irigoro n'okwa onyeisiala. Ụlọomeiwu kachasị na mba Bolivia kwadoro Anez maka ihe o mere. Ngagharịiwe na-aga n'ihu na Bolivia maka ọchịchị ọjọọ. Mmiri ejula elu na ala na Venice Ụlọahịa ndị mmadụ jupụtara na mmiri Mmiri etojuola elu na ala n'obodo Venice dị na mba Ịtali. Nke a mere ka ụlọ obibi nakwa ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ụlọụka dị icheiche jupụta na mmiri. Mmiri tojuru ma n'ime ụlọụka. Ụdị ihe dị etua emebeghị n'obodo ahụ kamgbe afọ iri ise gara aga. Mgbe ikpeazụ ihe dị otu a mere bụ n'afọ 1923. Naịjịrịa na Bene Repọblik Ụlọ ejula ugbua n'ogige ndị Super Eagles dịka ha na-akwado izute mba Benin Republic na mgbede Wenezdee. Asọmpi a bụ iji tozuo maka iko mba Afrịka nke afọ 2021. Ọ ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede taa n'ama egwuregwu nke dị na Uyo, Akwa Ibom Steeti. Ka ọ dị ugbua, ndị otu 'Super Eagles' niile zuru ezu n'Uyo na-eche ka oge ekeremgba ruo. Ụmụ Naijirịa ewepụla onwe ha ihere Otu egwu bọọlụ Dream Team nke Naịjirịa emechapụla onwe ha ihere mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Zambia n'asọmpi iko mba afrịka maka ndị akarịghị afọ iri abụọ na atọ. Otu atọ kacha mee ọfụma n'asọmpi a ga-etozu ịnọchite anya Afrịka n'asọmpi Olympics nke 2020. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" afirika-52270422,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52270422,Physically Challenged Artist: 'Ihe mere m jiri akụziri ụmụaka ise ihe',Ọtụtụ mmadu na-eche na onye nwere ọrụsị anaghị emenwu ụfọdụ ihe mana Nsoedo Peter na-egosi na nke ahu abụghị eziokwu.,Ntoroọbịa a dị afọ 27 na-ese ihe ma na akụziri ndị mmadụ etu e si ese ihe. Maazị Peters nwetere ọlụsị site n'ọgwụ nne ya ṅụrụ oge ọ dị ime. O sị na o bụ nne ya mere ka ọ kwụsị iche uche maka etu ndị mmadụ si ahụ ya. Ndị mere ihe onyonyo a: Chiemela Peter na Ikechukwu Kalu. egwuregwu-49300303,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49300303,Liverpool vs Norwich City: Anwụrụla Norwich pịgbuo ka agbụsị,Liverpool gosiri Norwich City ihe ha ji bụrụ ọkaibe na mba Yurope,"Mohamed Salah (n'aka ịcha) Norwich wetara onwe ha ihe mgbu site n'inye onwe ha goolu nkeji 7 site n'aka Grant Hanley. Nke a nyere Liverpool ikike ịgba ha ụjọ na-ahụ nke mere Mohamed Salah ji mezuoabụọ na nkeji 19. Norwich nwetere ohere ole na ole ime Liverpool ihe mana ha ejighi ohere a kpọrọ ihe. Liverpool dịka ndị ejighi ọchị malite asọmpi nke afọ a wụnyere ọgbụ goolu atọ site n'aka Virgil Van Dijk na nkeji 28. Tupu otu ọkara agwụcha na nkeji 42, Divock Origi mezuru ọkpụ anọ chara acha. Divock Origi (aka nri) enyela Liverpool goolu n'ụbọchị niile n'izuụka Agbanyeghi etu ọnụọgụgụ goolu siri kwụrụ na agba nke mbụ, Norwich nyekwara ndị azụ Liverpool nsogbu n'agba nke abụọ ebe Emiliano Buendia kpịanyere Pukki bọọlụ ojiri dọkata otu ha ji chịa obele ọchị. Ọkacha gbaa - Divock Origi (Liverpool) Mohamed Salah nwara ọfụma mana Origi nọ n'ihu ya n'asọmpị a j" 42924983,https://www.bbc.com/igbo/42924983,Ebe ndị Naịjirịa gara n'ahịa orire na ọzụzụ,"Emechiela ahịa orire na ọzụzụ nke egwuregwu bọọlụ, mana ebee ka ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa na-agbazị ugbua?","Ahmed Musa na Brown Ideye so n'otu Naịjirịa buliri iko mba Afrịka na 2013 Ahịa orire na ọzụzụ nke ndị egwuregwu bọọlụ mechiri n'ụbọchị ikpeazụ nke Jenụwarị, ka ọtụtụ ndị egwuregwu si n'otu ebe ha nọ gafee n'otu ndị ọzọ. Ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa so na ndị si n'otu klọb gafere ọzọ. Elderson Echiejile so n'otu Naịjirịa buliri iko mba Afrịka na 2013 Ebe ha si na ebe ha gara" afirika-52591975,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52591975,Alkaline water: Nke bụ eziokwu gbasara 'Alkaline water',Mmịrị bụ ndụ bụ okwu ndị Igbo na-ekwu kemgbe ụwa.,"Nke a pụtara na nwafọ ọbụla maara na ịṅụ mmịrị bara ezigbo uru n'ahụ mmadụ. Mmụta gosiri na mmiri dị, mmiri dikwa. Ọ nwere nke ha na-akpọ mmiri nwere ""alkaline"", ya pụtara na akalaịn dị n'ime ya gbagotere. Mmụta a na-ekwu na ọtụtụ mmiri anyị na-aṅụ enweghị akalaịn ruru ka achọrọ. Nke a pụtara na ọ bụ naanị asidi ka ha nwere. Ndị otu mmụta a na-akọwa na ọ bụ nri maọbụ mmiri nwere akalaịn bụ kpoo. Ọ nwekwere ọtụtụ ndị ama ama bu okwu akalaịna n'isi ọkachasị n'ala Bekee. Udi mmadụ dịka otiegwu Beyonce nakwa elewe ejeghị ọrụ bụ Miranda Kerr. Ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị na-akọwa na mmiri akalaịn bụ ịgba n'ahụike mmadụ maka na ọ na-agwọ ọrịa, ma na-egbochikwa ọrịa kansa, eme ka onye buru ibu fochanata ma na-emekwa ka ahụ mmadụ na- akwọ mụrụ mụrụ. Ụfọdụ n'ime ha sịkwa na nri na mmiri akalaịn na-emekwa okonye aka nka. Okwukwe ndị a bụ na asịdị na-eme ka ọrịa na-eto mmadụ na ahụ mana ọ na-ahịa ahụ ka ọrịa too n'ime ahụ nwere akalaịn otu achọrọ. Lisa Drayer bụ onye wetegoro ọtụtụ nturu ugo n'ihe gbasara nrị na ndozi ahụ, bụrụkwa onye ntaakụkọ ihe onyonyo na-okwu gbasara nri na ịchọmma kwenyere na ""akalaịn na-enye aka ịgbarị asịdị n'ọbara mmadụ ma nwekwaa ezigbo uru ọ bara n'idozi ahụ mmadụ'. Mana Anselem Obeta bụ dibịa ọnatarachi bụ otu n'ime ndị ji usoro ọnatarachị agwọ ọrịa sị na ndị ahụ amaghị ihe na-ekwu. Ọ sị na ya malitere iji mmiri akalaịn agwọ ọrịa kemgbe 2015. Obeta sị na ""e ji m ya gwọọ nwunye m mgbe ọ nwere ọrịa obi"". Ebele Ilo sị na ahụ dị ya mma kemgbe ọ malitere ịṅụ mmiri akalaịn ọnwa asatọ gara aga Ebele Ilo bụ nwaanyị gbara afọ iri iri isii sị na ""kemgbe m malitere ịṅụ mmiri akalaịn a ihe niile na-eme alaala. Ebele bụ onye ṅụgọrọ mmiri a ọnwa asatọ sị na ọ gwọrọ ya anya mgbu, ọkpa mgbu na afọ mgbu na-enye ya nsogbu kemgbe. Gịnịdị bụ akalaịn a ana-ekwu maka ya? Ihe akalaịn na-akọwa bụ ọnụọgụ pH dị na mmiri ọbụla. Nke a pụtara na pH bụ ọnụọgụ eji atụ asịdị maọbụ akalaịn dị n'ihe. Ọnụọgụ a na esi na efuu ruo iri na anọ (0 - 14). Nke a pụtara na ihe nwere otu pH bụ asịdị nke nwere pH asaa gbagowe bụ akalaịn maọbụ base. Mmiri akalaịn na-enwe pH karịri mmiri nkịtị anyị na-aṅụ. Akalaịn bụ mmiri pH ya gbadotere karịa mmiri nkịtị anyị na-aṅụ. Nke a mere ọtụtụ ji ekwu na ọbụrụ na mmadụ ṅụo mmiri akalaịn nke ukwuu, na ọ ga-enye aka gbarie asidi dị onye ahụ n'ahụ. Akwụkwọ akụkọ Healthline na-akọwa na ọbụghị naanị na pH gbagotere mere ka mmịrị akalaịn bụrụ kpoo, ihe ọzọ bụ na ya bụ mmiri kwesiri ịnwe ihe ndị ọzọ na-enyere ndụ aka Bekee kpọrọ 'minerals' na nke ha kpọrọ ""negative oxidation reduction potentials"" ( ORP). Ọ bụ ORP a mere ka ya bụ mmiri nwee ike iwepụ ụnyị nke ime ahụ bụ ""antidoxidant"", na Bekee. Ya bụ pH dị na ọtụtụ mmiri nkịtị anyị na-aṅụ erughị asaa. Asaa bụ okeala asidi na akalaịn maọbụ ""base' dịka Bekee kpọrọ ya. Mmiri pH ya erughị asaa bụ asịdị mana nke si n'asaa gbagoo asatọ maọbụ itoolu bụ akalaịn. Mmiri pọmpu ụfọdụ dị mma na-ejisike eru pH asaa, nke pụtara na ha bụ asịdị. Malinda Malkani bụ isiahụrukwaokpu n'ihe gbasara erimeri sị na ihe mere mmiri o jiri bụrụ akalain bụ maka na o nwere nnu na metalụ n'ime ya. O kwukwara na ihe kacha ebuta mgbanwe na pH dị na ọbara mmadụ bụ ọrịa. Ọ chọpụtakwara na ụdị nrị mmadụ na-eri nwere ike ịme ka asidi gbagote na ọbara onye ahụ. Ebe ọrịa uhe (Kidney) nwere ike ịmekwa ka akalịan onye ahụ gbagote. Ọtụtụ nri dịka miliki, bụredị, nri eghere eghe, bọta, akwa na ndị ọzọ nwere ike iweli asịdị di na ọbara gị. Ebee ka mmiri akalaịn sị abịa? Mmiri akalaịn bụ ọnatarachị na-esi na mmiri ọgbanaokwute ụfọdụ apụata. N'elu okwute ọ na-agba ka o sị enwete akalaịn ya. Ọnwekwere mmiri akalaịn bụ akamere. Ndị kọmpịnị ụfọdụ na-arụpụtakwa nke ha n'ololo dịka ụdị nke esi na mmiri ọgbanaokwute dị n'Ikogosi n'Ekiti steeti. Ụfọdụ chọrọ ime nke ha nwere ike ipinye lemonụ na mmiri. E nwekwara ololo latrik na-enye aka eme ka mmiri agbanyere na ya ghọọ akalaịn site n'ije Bekee kpọrọ 'water ionizer' bụ nke ga-ekewa akụrụngwa mmiri ahụ ụzọ abụo wepu asịdị dị na ya hapụ akalaịn. Gịnị ka sayiensi kwuru maka mmiri akalaịn? Nke bụ eziokwu bụ na ọnwebeghị ihe nchọputa kwuru gbasara ka akalaịn ọ dị mma ka ọ dị njọ n'ahụ, dịka Malkani si kwuo. Malkani na-eche na ""nke ahụ bụ otu n'ime akụkọ na egwu Mike Ejiagha ndị mmadụ na eforo onwe ha ịsị na mmiri akalaịn na-agwọ nta agwọ imo. Ojikwa agwọ kansa, agwọ gbogbotigbo"". Drayer na onwe ya kwuo na ya bụ echiche ndị mmadụ gbasara mmiri akalaịn enweghị mgborogwu na sayensi cha cha. O kwukwara na nchọpụta niile e megoro gbasara mmiri akalaịn bụ ka o siri metuta ụmụanụ. Drayer kwuru na ""onwebeghị nchọpụta e mere na ya bụ ihe ka o si metuta mmadụ"". Malkani na onwe ya sị na ""ọbụru na ahụ mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma, ọnweghị ihe ga-eme pH dị na ọbara onye ahụ"". Ọ sị na ọ bụ amaghị ihe ka ndị mmadụ ji iche na ya ga-erite maọbụ ṅụta akalaịn n'ọnụ. Drayer sịkwa na oke akalaịn n'ọbara nwekwara ike ibutere mmadụ akpụkpa n'ahụ maọbụ afọ mgbụ. Mmadụ abụọ a kwenyere na ahụ mmadụ nwere ihe niile ọchọrọ iji hụ na asidi maọbụ akalaịn dị mmadụ na aṅụ akarịghị ibe ya na ahụ. Mana nchọpụta e bipụtara na akwụkwọ nchọcha akpọrọ ""2012 study"" nke ndị National Institute of Health n'Amerịka bụ nke a nakwanyere nke ugwuu sị na ịṅụ mmiri akalaịn nke pH ruru 8.8 nwere ike ịgwọ obi ịchaọkụ Bekee kpọrọ ""acid Reflux"". Akwụkwọ akụkọ Healthline kwukwa na nchọcha ọzọ chọpụtara na mmiri akalaịn nwere ike ịgwọ ọrịa shuga, ọbara mgbalielu nakwa abụọ ọjọọ dị na-akwara Bekee kpọrọ ""high cholesterol"". Ya bụ akwụkwọ akụkọ dekwere nchọcha e mere nso nso a bụ nke otu narị mmadụ so n'ime ya chọpụtara ihe dị iche n'etiti ndị na-anụ mmiri akalaịan na ndị anaghị aṅụ ya. Ya bụ nchọpụta gosiri na akalaịn ji ihe dịka pasent 6.3 butuo mkpụkọ ọbara karia ndị anaghị aṅụ ya bụ nke ha ji pasent 3.36 were rịdaa. Nke a pụtara na ọbara ndị na aṅụ mmiri akalaịn na-ekwo nke ọma karịa nke ndị anaghị aṅụ ya. Agbanyeghị ihe ndị a, ndị sayensi sị na ọ bere nchọcha a ezughị n'ime ka ekwetacha ihe niile ndị bu ya bụ ọgụ n'ise kwuru. Ihe akalaịn nwere ike ime gị n'ahụ Ọ bụ eziokwu na ịṅụ mmiri akalịan dị mma n'ahụ mana ọ nwekwara ike ibutu asidi dị n'afọ nke na-enye aka ekwe nri ma na-egbukwa ụmụ nje n'afọ, na-egbochi ha n'ịbanye n'ọbara. Ọzọ bụ na oke akalaịn n'ahụ na-ebute ọnọdụ Bekee kpọrọ ""Alkalosis"" bụ nke nwere ike igosipụta dịka agbọ, aka ọmajijiji, mọzụlụ ịmajijiji, maọbụ uche efu. A sịkwa na ọ nwere ike ime ka kalshum mmadụ gbadaa bụ nke nwere ike imetụta ọkpụkpụ. Obeta sị na mmiri akalaịn na-enye nsogbu n'ahụ bụ nke akamere. Ọ sị na nke ọnatarachị nakwa nke eji ọkụ latrik mee enweghị nsogbu ọbụla. Mana ruo mgbe sayensi ga-eme nchọcha nke juru ha afọ, ndọrọ ndọrọ dị na mmiri akalaịn agaghị ebi. Akụkọ ga-amasị gị" 42935671,https://www.bbc.com/igbo/42935671,Egwu di na Kaduna ka ọdụm gbara ọsọ na Zoo,Ọdụm a kpọsara na zoo dị na Gamji Gate bụ ama egwuregwu dị na Kaduna gbapụrụ ọsọ.,"Gamji GATE anụ ohịa one na one. Ọdụm a bu otu na ime ha. Ndị na-ahụ maka Gamji Gate a kwuru na ọdụm a bara otu na ndị na-elete ya anya ọgụ mgbe ha ejere ị nye ya nrị, wee gbapụ. Ndị mmadụ gbapụrụ ọsọ mgbe ha nụrụ na ọdụm a si ebe e o na anọ pụọ. Ndị BBC Hausa jere ebe ahụ kwuru na ọdụm a mechere naghachi ebe o na anọ n'onweya. E dowere anụ ọhịa dị icheiche na Gamji Gate." afirika-48237272,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48237272,Ihe ngwa egwu Igbo jiri masị anyị - Chikaima na Chinonoru,Chikaima na Chinonoru bụ nwanne abụọ ngwa egwu Igbo na-amasị,"Chikaima na-akpọ ọja ebe nwanne ya na-akpọ 'Xylophone' N'ime ihe onyonyo a, ha kọwara BBC Igbo etu ha sị mụta na ihe ndị ọzọ." afirika-51432790,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51432790,Deezell na Maryam Booth: Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ ha na-agbagha?,Maryam Booth bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa ama ama ekwuola ihe ọ ma maka ihe nkiri mgbarịọtọ a na-eche na ọ bụ ya na-efegharị n'elu soshal midia.,"O depụtara n'akara Instagram ya na ọ bụ onye bụbu ọyị ya nwoke akpọrọ Ibrahim Ahmad Rufai sere ya foto mgbarịọtọ ahụ mgbe ha na-eme enyi n'afọ atọ gara aga. End of Instagram post, 1 Ọ kwuru na Rufai na-ana ya ego ka ọ ghara iwepụta ya bụ foto mana ọ gbagwojuru ya anya ka ya bụ foto si pụtakwazịa n'elu soshal midia. Ọsịsa ya na-abịa ka Rufai onye eji Deezell wee mara gọnahụrụ ya bụ okwu site n'idepụta ogologo okwu n'akara twitter ya. Kamgbe ahụ ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia. @fag_glamour si na ihe nke a gbagojuru ya anya. @ArewaWoman kwuru na ọ bụ ọyị rara Maryam Booth nye @EagleAdekoya kwuru na onye ọbụla na-eme ọfụma ga-enweriri nkatọ. Ụmụ ụwa ka na-eche ka ha hụ ihe ọzọ ga-esi na ya bụ okwu pụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49275697,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49275697,"Oby Ezekwesili, Dora Akunyili na agbara nwaanyị ndị ọzọ si Anambra state Nigeria enweghi ike ichefu",Akụkọ gbasara Naịjirịa enweghi ike izu oke ma ọ bụrụ na akpọpụtaghị aha ụfọdụ ụmụnwaanyị Anambara steeti.,"Ụmụnwaanyị a emeela ọtụtụ ihe n'ụzọ dị iche iche, ndị mmadụ agaghị akọcha ma n'ọnwụ ha. A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, nchekwa akụnaụba nakwa ihe ndị ọzọ, ha kwụ chịm. Ngwa lee ka BBC Igbo si agba ha n'anwụ: Sharon Ikeazor Ikeazor rụrụ dịka onyeisi ndị Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD) tupu e mee ya minista Ikeazor bụ Minista steeti na-ahụ maka Gburugburu nke Bekee kpọrọ Ministry of Environment. O so n'ime ụmụnwaanyị asaa Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara maka ọchịchị n'ụbọchị 21 nke Ọgọstụ 2019. Oby Ezekwesili Ezekwesili bụ ezigbote agbara nwaanyị a ga-akpọ ""a kwaa a kwụrụ"" n'okwu gbasara Naịjirịa. A ga-akọ ole ghara ole maka nwaanyị a pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, na-ama gọọmentị aka n'ihu ma bụrụkwa onye na-ebu ịzọta ikike dịrị onye n'isi? Ezekwesili arụọla dịka minista ugboro abụọ na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo chịrị, ma sorokwa n'ime ndị Naịjirịa rụtụrụla na ngalaba ụlọakụ mbaụwa a na-akpọ World Bank. A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ 1963. Virgy Etiaba Etiaba chịrị site n'ụbọchị abụọ nke Nọvemba 2006 ruo Juun 13 nke 2007. Ị ma na ọ bụ Etiaba bụ nwaanyị mbụ chịrị steeti ọbụla na Naịjirịa? Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti, rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1942, dịka wikipedia si kwuo. Stella Oduah: Oduah arụọla dịka sinetọ na-anọchite anya ndị Anambara Nọt n'ụlọomeiwu ukwu afọ Agaghị akọwa akụkọ ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu ghara ịkpọta Oduah aha. Ọ gbara mbọ hụ na e mezigharịrị ya mgbe ọ na-arụ dịka minista na-ahụ maka njem ụgbọelu n'okpuru ọchịchị Goodluck Jonathan. A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị, 1962. Dora Akunyili O nwetara nturuugo ruru narị itoolu n'ọrụ ọ rụrụ Otu nwaanyị a na-asị ""unu abịala""; nwaanyị a mere ihe e ji echeta ya ma n'ọnwụ. Akunyili zọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ site n'ibuso ndị na-arụpụta ọgwụ adịgboroja agha, oge ọ rụrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ a kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC). Ọ rụrụ dịka minista na-ahụ maka mgbasa ozi site n'afọ 2008 ruo 2010, tupu ọ zọọ ọkwa onye omeiwu ukwu ga-anọchite anya ndị Anambra Sentralụ; mana Chris Ngige ekweghi ya zọta oche ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị 1954, ọ nwụọ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun 2014. Uche Ekwunife Ekwunife rụkwara dịka onye nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta. Ekwunife arụọla dịka sinetọ na-anọchite mpaghara Anambara-Sentralụ site n'afọ 2015 mgbe ya na Victor Umeh zọrọ oche ahụ. Ọ kwara ya dịka o si otu pati wụkpuo na pati ọzọ mana o mechara, zọtakwa oche ahụ ọzọ na ntuliaka 2019. Ọ gụrụ akwụkwọ ma rụọ ọrụ dịka onye ọrụ ụlọakụ tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jenụwarị, 1970. Stella Okoli O nwetala nturuugo Officer of the Order of the Niger, OON nakwa Member of Order of Nigeria, MON Okoli so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ahụike na Naịjirịa. Ụlọọrụ ya na-emepụta ọgwụ ndị mmadụ na-eji achụ ọrịa dị iche iche malitere dịka ọnụahịa ebe ọ na-ere ọgwụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị nke afọ 1944. Chimamanda Adichie Adichie bụ onye odeeakwụkwọ a ma ama na mba ụwa niile Adichie so n'otu ada ndị Anambara ji aba mba ma na Naịjirịa ma na mba ụwa gbaa gburugburu. Ọ bụ site n'ihe o detere n'akwụkwọ dịka ode akwụkwọ pụrụiche? Ka ọ bụ site n'okwu o kwutere site na nkwenye o nwere na nwoke na nwaanyị ha nhatanha nke a kpọrọ ""feminism"" na Bekee? A ga-ekwu ole ghara ole ebe ọ gbasara nwaada a? Ọ bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo okwu ebe niile enwuru ọkụ. O nwetala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite karịrị iri. A mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 1977. Lynda Chuba Ikpeazu Chuba-Ikpeazu bụ ""nwaanyị kacha maa mma na Naịjiria"" nke afọ 1986 ma bụrụkwa ""Miss Africa"" nke afọ 1987. Ọ bụrụ na ị chetaghị ya maka nke ahụ, ị cheta ya dịka nwaanyị na-amuke ka anyanwụ ụtụtụ n'ụlọomeiwu nta ebe ọ rụrụla dịka onye nnọchiteanya ndị Ọnịcha Nọt-Saụt site n'afọ 1999 ruo ugbua. Ọ gụrụ akwụkwọ ịbụ ọkaiwu, onye mgbasaozi nakwa azụmahịa. A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun, 1966. Ndidi Nwuneli Nwuneli na-acha ka anyanwụ ụtụtụ bụ onye ịrụ ọrụ n'efu na-amasị, ihe gbasara Igbo na asụsụ ya na-amasịkwa ya nke ukwuu. Ihe gbasakwara ngwa e ji esi nri doro ya anya, mere o ji jiri ya merekwa ọrụaka. O nwetala nturuugo Member of the Order of the Federal Republic (MFR). A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, 1975. Chioma Chukwuka-Akpotha Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka Akpotha malitere ime ejije na Nollywood n'afọ 2000, egosila na ọ bụ ""dike n'agha"" na ngalaba ahụ. O nwetala ihe nrite na nturuugo, ma soro na ndị aha ha na-ewu ewu maka akaọrụ ha na Naịjirịa. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Maachị 1980. Clarion Chukwurah E chiri ya echichi ""Ada e ji eje mba 1"" nke ndị Ọnịcha. Chukwurah so na ndị a ga-akpọ anụ a na-agba egbe ọ na-ata nri ma a bịa n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood. O meela ọtụtụ ejije a ga-eji cheta ya kemgbe 1980 ọ malitere. A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị, 1964. Kate Anolue Anolue bụ ""Mayor"" obodo Enfield dị na mba Briten. Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka. A mụrụ ya n'ọnwa Mee n'afọ 1949. Sally Mbanefo Mbanefo gụrụ akwụkwọ dịka onye ọrụ ụlọakụ, arụọla dịka onye na-elekọta ihe gbasara nlegharị anya nke Bekee kpọrọ ""Tourism"" oge Goodluck Jonathan chịrị. Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano nyekwara ngalaba ahụ ma tụkwasịrị ya ihe gbasara ndị Naịjiria bi na mba ofesi ka ọ na-elekọta dịka kọmishọna na steeti ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febụwarị, 1965. Chi Onwurah A mụrụ ya na mba Briten mana ezinaụlọ ya lọtara Ọka n'otu afọ ahụ, mana ha nne ya kpọrọla ha laghachị Briten mgbe agha Biafra nke nna ya so n'ime ya, dapụtara. Onwurah bara ọchịchị dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị obodo Newcastle Sentralụ na mba Briten, n'ọnwa Mee, 2010, ebe ọ nọ ruo ugbua. Nke a mere ka ọ bụrụ nwaanyị mbụ bụ onye isi ojii ga-abụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu ndị Briten. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Epreelụ 1965. Chinwe Chukwuogo-Roy E mere ya ""Member of the Most Excellent Order of the British Empire"" n'afọ 2009 Chukwuogo-Roy bụ nwaanyị isi ojii mbụ sere eserese Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ nke mba Briten. A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1952, mana ọ nwụrụ n'ọnwa Disemba 2012. Ụmụnwaanyị ndị ọzọ gụnyere Josephine Anenih, Flora Azikiwe, Joy Emordi, Nelly Uchendu nakwa Ngozi Ezeonu. Kedụ ndị ọzọ kwesịrị ịnọ n'akụkọ a? Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" afirika-53385045,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53385045,Ruth Okafor :Mmegbu kpatara m ji bido igbu pịpịrọ n'asọmpị bọọlụ,Nwaada Ruth Nwadinma Okafor na-egbu pịpịrọ n'asọmpi bọọlụ kọwara etu njem ya si malite n'igbu bọọlụ.,Ọ sị na o bu ụzọ malite ịgba bọọlụ mana mecha banye n'igbu egbu n'ihi etu otu onye ogbu bọọlụ si gbujọọ asọmpi nke mere ka e merie ha. Okafor sị na o ji we ahụ na mwute ga mụọ etu e si egbu pịpịrọ na bọọlụ bụ 'referee' na Bekee. Ọ kọwakwara etu o si nwete ọzụzụ ịzọ ndụ ndị ọgba bọọlụ dara n'ọgbọegwuregwu bọọlụ nakwa ụfọdụ n'ime ọ zọrọ ndụ. Okafor nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla gbalịa chọpụta akaraka ya ma soro ya na-eleghi anya n'azụ. Kirie ihe o kwuru n'uju; afirika-49254836,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49254836,Bank robbery: Ndị ojiegbeezu awakpoola ụlọakụ n'ehihie na abọ mụ anya,Ndi uweojii Ondo steeti ekwuola na ha kụrụ ndị ojiegbeezu wakporo otu ụlọakụ dị n'Iju n' okpuru ọchịchị Akure-North n'Ondo steeti n'ehihie Tuzde njọ ahịa dịka o nweghị ihe ha zutere.,"Mana ndị omekome ahụ gburu otu onye ọrụ ụlọakụ ahụ, ebe ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara ka ndị ekperima ahụ wụchiri ụlọakụ ahụ wụwa mgbọ n'ehihie na abọ mụ anya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC Igbo na ""o nweghị ihe ha zutere."" O kwuru na ndị ọrụ ha nwetara ozi na ndị omekome zọchiri n'ụlọakụ ahụ, ma zaa oku a kpọrọ ha ngwangwa. Joseph, onye gbara ama na mkpọ tụrụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ oge ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ kwuru na ndị ekpereima ahụ ghaara ụgbọala abụọ ha jiri bịa ije ọjọọ ahụ, gbalaga. Lee ngagharịiwe ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere maka ụgwọ e ji ha Ọ gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-esi imi n'ala inweta ndị nyụrụ ihe na-esi ebe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium" mba-uba-43552585,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43552585,Mba 20 esonyela ịchụpụ ndị Rọshịa,Mba Ọstrelia abụrụla mba ọhụrụ so achụpụ ndị mba Rọshịa nọ na mba ha arụ ọrụ dịka ndị nyocha nzuzo iji kwado mba UK maka nsị e nyere onye bubu onye nyocha nzuzo nke Rọshịa nọ na UK.,"Onyeisi mba Ọstrelia bụ Turnbull kwuru na agwa a bụ maka ihe ndị Rọshịa mere Onyeisi mba Ọstrelia bụ Malcolm Turnbull kwuru na nsị ahụ e nyere na Salisbury bụ agha e busoro mba niile. Ihe karịrị ndị ọrụ Rọshịa mmadụ 100 ka-achụpụrụ site na mba dị icheiche na US na Eu ụnyaahụ. Mba Rọshịa ekwela nkwa na ha ga-azaghachi mba ndị niile chụpụrụ ndị ha etu ha si mee ha. Rọshịa agọnarịala na aka ha dị na nsị ahụ e nyere Sergei Skripa na nwa ya nwaanyị, Yulia na Salisbury dị mpaghara ọdịda mba Ịngịland. Ndị nyocha kwuru na nsị ahụ e nyere ha bụ ngwọagha ndị agha dịka mmadụ abụọ ahụ ka nọ n'ajọ ọnọdụ n'ụlọọgwụ. Ọstrelia na-achụpụ mmadụ abụọ bụ ndị nyocha nzuzo a na-amaghị maka ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43557830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43557830,Enwe achụpụla ndị mmadụ na Soluyi/Sosanya dị na Legọs,"""Ị zụta ngwa nri dowe n'ụlọ gị, ị bata n'ụlọ otu ụbọchị ị hụ ka nri gị kwasara n'ala, ọ bụrụ na enwe akụwaala mpio gị, bata zuru nri gị."" Ihe a bụ ihe ụfọdụ ndị na-ahụ na Legọs.","Ndị mmadụ na-ekwu na nsogbu enwe na-enye ha abụghị ọbere ihe, ma kpọkuo gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka Otu onye bi na Sosanya, Gbagada dị na Legọs, bụ Gabriel Wopariwa, gwara BBC Pidgin na ""enwe na-enye anyị oke nsogbu"". O kwuru sị ""ọ bụrụ na ị debe nri gị n'ụlọ ma ị mechighị ọnụụzọ gị nkeọma, etu a ka enwe ga-esi bata richaa nri ị dowere."" Akụkọ ga-amasị gị: Agbataobi Soluyi na Sosanya bụ ebe ka na-emepe emepe maka na ọ dịbu ka ime obodo mbụ Wopariwa kwuru sị na ụfọdụ n'ime ha agabuola mkpesa na gọọmentị ime obodo Kosofe, mana onweghị ihe ha gatara. Ndị agbataobi ahụ na-arịọ ndị gọọmentị ka ha gbalịa chụpụ enwe ndị a maka na ha na-awakpozi ndị mmadụ ugbua. Ha kwuru na otu enwe busoro otu nwoke agha mere ka ebuga nwoke ahụ ụlọọgwụ, n'ihi na nwoke ahụ chụrụ ya ọsọ ka ọ chọrọ izuru akịbekee ya. Ndị bi n'agbataobi Soluyi kwuru na ha na-ahụbu enwe ndị a ka ha nọ n'osisi n'ime ọhịa mgbe ebe ahụ ka bụ ime obodo, mana ugbua enwe ndị a na-enyezi ha nsogbu Ichie Akin Adedoyin kwuru na o biela na Soluyi kamgbe afọ 1985. O kwuru na oge ebe ahụ bụ ime obodo enwe ndị a bi n'ime ọhịa, na ha-anaghị enweta mkpesa ọbụla, mana ugbua obodo ahụ bidoro imepe, ha enwetela mkpesa karịrị akarị. Ha kwukwara na o nwere otu nwoke bi ebe ahụ enwe ndị a na-agbakọ n'ụlọ ya, mere ha ji na-enyo ma ọ na-azụ ha azụ. Ka agbataobi ahụ na-emepe, enwe ndị a enweghị ebe ha ga-anọzị maka na asụchaala ọhịa dị n'ogige ahụ ma mechie ọwara oke osimiri dị ebe ahụ Onye ọzọ bi n'agbataobi ahụ bụ Joshua Okeke, kwuru na ọ na-eche na enwe ndị ahụ nwere ike ịbụ mmadụ maka etu ha si ahazi onwe ha. O kwuru sị na itinyegodiri ha nsị na nri debe, ha agaghị eri ya. O kwuru sị na enwe ndị ahụ anaghị achọ ụmụaka okwu, na ha na-egwusa ha egwuregwu, mana ha na-aba ndị okenye ọgụ. Ndị agbataobi Sosanya kwuru na enwe ndị a na-apụta site n'elekere isii ruo asatọ nke ụtụtụ, ma pụtakwa n'elekere ise nke mgbede oge ha na-ebido ịchọ nri. Ụjọ na-atụ ha ka enwe ndị a ebunyela ha ọrịa." afirika-56712203,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56712203,Ebubeagu: Ihe pụtara na nzụkọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nwere maka nchekwa ala Igbo,"Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ, ndị okpukpere chi, ndị Eze ọdịnala, otu Ohaneze na nzụkọ maka nchekwa ala Igbo bụ South East Joint Security Committee nwere nzụkọ taa bụ ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Aprel afọ 2021, n'obi gọvanọ Enugwu steeti.","Gọvanọ David Nweze Umahi nke Ebonyi steeti gụpụtara ihe ha kpebiri na nzụkọ ha : Lee ya nzụkọ ha dịka esiri seta ya: Ndị Ekperima na-eso ndị Ipob na Eastern Security Network N'azụ Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ọtụtụ ndị omekome na ndị ekperima na-ezo n'azụ Eastern Security Network nakwa Ipob arụ arụ dị ịcheiche. O kwuru nke a na mkparịataụka ya ndị ụlọ mgbasaozi CHANNELS na-enwe gbasara nchekwa n'ọwụwa anyanwụ. Ebube Agu: Lee ajọ ọnọdụ nchekwa butere nhibe otu nchekwa ahụ ""Nke bụ eziokwu bụ na ndị otu nzuzo na ndị omekome juru ebe niile. Ihe na-emezi bụ na ndị abụghị ndị otu Ipob na ESN ga-aga kpaa arụ ma na-achọ aha"" ""Ọ dịịrị ha mfe iji aha ESN na Ipob kpuchie onwe ha n'aka gọọmentị etiti"" ""Nke a na-eme n'ihi na ndị Ipob apụtala ọtụtụ oge kwuo na ha abụghị ndị na-eyi ndụ egwu nakwa ndị na-agba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ abụghị ndị nke ha"" ""Kedụzia ihe a ga-eme okwu a?"" bụ ihe ndị o kwuru. O nweghi ihe jịkọrọ Ebubeagụ na ESN nke Nnamdi Kanu hibere - Governor Umahi Onyeisoche otu jikọrọ ndi gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na otu nchekwa ehibere n'ala Igbo bụ Ebubeagụ amalite ọrụ kemgbe. Ọ kọwara na ọ bụghị ihe gbatagbata mere eji kpokọbaa ndị otu nchekwa ahụ. N´otu aka ahụ kwa Umahi kwuru na iwu ga akwado ha ibu ngwa ọgụ iji hụ na enyere mpagara ọwụwa anyanwụ nchekwa tọrọ atọ. N´okwu metutara mmaja otu ESN majara otu ọrụ nchekwa Ebube Agu ,David Umahi kwuru n´eze wara awa. O kwuru na otu ọrụ nchekwa ESN nke Nnamdi Kanu gwuzobere enweghi nkwado iwu ọbụla n´ihi ya hụta ha dika ndi ekperima, gbanye na otu ọrụ chere otu ụrụ nchekwa ebube agụ n´ihi bụ ihụ na ihe nile gbasara ndi omokome bụrụ akụkọ ochie na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa. Etu otu nchekwa ọhụrụ a ga-esi arụ ọrụ N'iji zaa ajụjụ etu otu nchekwa ""Ebube Agụ"" ga-esi arụ ọrụ, gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steetị so na ndị hiwere ya tinyere ọnụ na ya Mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV, Gọvanọ Ikpeazu sị na ""Ebube Agụ"" pụtara mkpuchi, nchekwa gburu gburu ebe obibi nakwa ikike. Ọ sị na Ebube Agụ ga-arụ ọrụ n'uju dịka otu nchekwa, na a ga-enye ha ngwa ọrụ nwereike ịma ndị omekome chere ha aka n'ihu agha. O kwuru na Steetị dị n'Ọwụwa Anyanwụ dị mbụ nwere otu nchekwa nke ha dịka 'Homeland Security nke Abia, 'Forest Guard' nke Enugu. Kama na ihe ha mere ugbua bụ ijikọ otu nchekwa niile a ọnụ n'aha Ebube Agu maka nzirita ozi na nchekwa tara ọchịchị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Ọ sị na ndị nchekwa Ebube Agu ga-agba mgbọrọgwụ n'ime obodo dị iche iche na mpaghaghara ahụ bụ ebe ha ga na-echekwa. Ikpeazu sị na ọrụ ndị a ga-elekwasị anya n'inwete kepukepu banyere nchekwa tupu ihe ọbụla a na-eme na mpaghara ahụ. O kwuru na ""Ebube Agụ ga-achụ onye ọbụla na-ekwesighi ịnọ n'ime ọhịa ọsọ"". Ọ gara n'ihu kwuo na gọvanọ steetị ọbụla ga-ewe mmadụ ole ikike ya ruru n'ọrụ nchekwa Ebube Agụ. Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ehiwela otu nchekwa ọhụrụ Ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ehiwela otu a kpọrọ 'Ebube Agu' maka nchekwa mpaghara ahụ. Ha kwuru na isiụlọọrụ Ebube Agụ ga-abụ n'Enugwu steeti. Ha mere nkwekọrịta a na nzukọ ha mere n'Owere, Imo steeti, taa bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Epreelụ 2021, ebe ha nọ kwuo maka etu mpaghara ọwụwa-anyanwụ si nọrọ n'ọnọdụ ọjọọ n'ihe gbasara nchekwa. Na nzukọ ahụ, ha bu ụzọ katọọ iyi ndụ egwu nakwa mkpamkpa ndị omekome na-akpa na moaghara ahụ, ma katọọ mwakpo na ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, mwakpo na ịgbapụta ndị a nwụchiri n'ụlọmkpọrọ nakwa ogbugbu ndị ọrụ nchekwa, ndị obodo nakwa ndị ọrụ ugbo. Ndị gọvanọ a gụnyere Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Willy Obiano nke Anambara steeti, Dave Umahi nke Ebonyi steeti, Hope Uzodimma nke Imo steeti na Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti, kwuru na gọọmentị etiti Naịjiria dọnyeere ha ukwu n'ihe gbasara ọnọdụ nchekwa, ma kwuo na ha na gọọmentị etiti ga-ejikọ aka buso mkpamkpa ndị omekome agha. Na nzukọ a ha kpọrọ 'South East Security Summit' bụ nke mbụ a na-eme maka nchekwa na mpaghara a, ndị gọvanọ kpebiri na ndị isi a hụrụ kwaba okpu gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego na ndị ọrụ nchekwa, ga-etikọta isi ọnụ ịhụ na a kwadoro ndị nchekwa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ iji hụ na e memilara mkpamkpa ndị omekome. Ha kpebiri ime nzukọ a kwa mgbe, ma hụkwa na e mere ya na steeti dị iche iche n'ọwụwa-anyanwụ oge ọbụla. Ha gwakwara ndị isi ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ kwuputa ihe ndị ha chọrọ, ga-enyere ha aka ibuso mpụ na omekome agha, nke ha bụ ndị isi mpaghara ọwụwa-anyanwụ ga-ahụ na o ruru ha aka ozugbo. N'otu aka ahụ, ndị gọvanọ kwuru ka onyeisi ndị uweojii kwụsị izite ndị otu ya, kama ka ọ hapụ ndị kọmishọna uweojii nakwa ndị nke ọrụ ha bụ ichekwa mpaghara ahụ ka ha rụọ ọrụ dịịrị ha. Ha kwukwara ka onyeisi ndị uweojii na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ kpọkuo Ohaneze Ndigbo na ndị ọzọ, iji mata ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghụrụ n'ihe gbasara nchekwa n'Ọwụwa-anyanwụ. N'aka ọzọ, ndị gọvanọ kwenyekwara na a machiela ịchị ehi agagharị, ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ debere iwu mmachi a. Ha rịọkwara ka ndị ọrụ ugbo na ndị ọchị ehi na-arụkọ n'udo, ka ndị gọvanọ nwee ike ibuso mpụ agha. Nzukọ a na-abịa dịka ọnọdụ nchekwa n'ọwụwa-anyanwụ banyere na 'ọgbara Igbo gharịị' n'ime izu ole na ole gara aga. Ọkachasị nke mere n'izu gara aga ebe ndị omekome wakporo ụlọmkpọrọ dị n'Owere ebe ndị nọ na mkpọrọ si gbafuo, nakwa ihe ruru ụlọọrụ ndị uweojii atọ n'Imo steeti." afirika-47484578,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47484578,Election 2019: A gbaala onye na-achuru Emeka Ihedioha nta vootu egbe,"Ndị Ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala onye na-achụrụ Emeka Ihedioha nta vootu, egbe.Dịka anya hụrụ ka o si mee bụ Eze Ugochukwu gwara BBC Igbo, nwaamadị a bụ Nsorom Nnamdi, natara ọnụ egbe abụọ site n'aka ndị Ojiegbe a bụ ụmụokorobịa abụọ ji ogbatumtum.","Ọ kwuru na Nsorom na-achụrụ Ihedioha na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'okpuru pati PDP vootu n'okpuruọchịchị Isu, zutere ihe mberede a oge ọ na-achọ ịbata n'ụlọ onye ji aha otu Pati PDP zọọ ọkwa Sineti n'Ọlụ zone . Eze gwakwara BBC Igbo na akpọrọla Nsorom Nnamdi gawa n'ogbe gbata-gbata nke ụlọọgwụ Federal Medical Center dị n'Owere. Mbọ onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ịnụ olu onye na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, kụrụ afọ n'ala, ebe o kwuru na ya nọ ebe ọ na-enwe nzukọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55925585,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55925585,Ban on open grazing: 'Anyị ka na-ahụ ndị ọchị ehi na-agbanyeghi mmachi e tinyere',Ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ka na-ahụ ka ndị ọchị ehi na-achị ehi agagharị na-agbanyeghi iwu mmachi gọọmentị tinyere na mpaghara ahụ.,Ha gwara BBC Igbo na nke a pụtara na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ anaghị agbaso iwu a mmachi ịchịgharị ehi ha tinyere. Ha kwuru na ehi ndị a na-abata n'ọrụ ugbo ndị mmadụ na-emebisi ihe ha kụrụ n'ugbo. Cheta na ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ machiri nchịgharị ehi n'obodo n'afọ 2019. Nke a mere ndị otu nchekwa 'Eastern Security Network (ESN)' nke otu Ipob hiwere ji sị na ha ga-agbaso iwu a n'obodo ndị dị na mpaghara ahụ. afirika-57097184,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57097184,Anthonia Ogugua: Ọ dịghị mfe ịbụ nwaanyị na-agba mkpọnala,Anthonia Ogugua bụ nwaanyị na-agba mkpọnala.,"Mkpọnala bụ egbe pụrụ iche nke na-egosipụta emume pụrụ iche n'ala Igbo. Ọtụtụ chebu na ọ bụ naanị ụmụ nwoke nwere ike ịgba ya bụ egbe. Mana Anthonia Ogugua egosila n'eziokwu na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwekwara ike ime ya karịa. Gere akụkọ ya n'uju n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo." mba-uba-44425348,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44425348,Buhari ewepụtala usoro a ga-eji nye Abiola nturu ugo,Ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa ewepụtala akwụkwọ gosiri etu a ga-esi nye nwaafọ Naịjirịa a ma ama laara mmụọ bụ Moshood Abiola na onye ọkaikpe a ma ama bụ Gani Fawehinmi na onye ndọrọndọro ọchịchị Babagana Kingibe nturu ugo nke gọọmenti etiti.,"N'akwụkwọ ozi ahụ odeakwụkwọ Boss Mustapha dere, o kwuru onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enye ndị ahụ nturu ugo n'ọnwụ. Iwu Naịjirịa akwadoghị ugo Buhari tụnyere Abiola - Belgore Juun 12: FFK, Fayose na nwa Abiola kwadoro Buhari Nturu ugo a ga-enye ha Akwụkwọ odeakwụkwọ dere kwuru na a ga-eme nturu ugo ahụ ụbọchị ọhụrụ onyeisiala Buhari kwuru na a ga na-emezi ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya bụ n'ụbọchị Juune 12. Cheta na a na-ekwu na MKO Abiola meriri ntuliaka e mere ụbochị Juunu 12 afọ 1993, ntuliak mbụ e mere kamgbe ndị agha kwaturu ọchịchị n'afọ 1983. Mana a kagburu ya bụ ntuiaka n'ọchịchị Ibrahim Babangida. Nturu ugo a bụ agbanyeghi na ụfọdụ ndị ọkaiwu na-agbagha onyeisiala maka mkpebi inye ha nturu ugo ahụ." mba-uba-43109600,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43109600,Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka mwakpo emere na Zamfara,Akụkọ na-apụta site Zamfara steeti na-ekwu na ndị uweojii nke Naịjria awuchiela mmadụ atọ echere na ha sonyere na mwakpo gburu ndị mmadu na Zamfara steeti.,"Ndị uweoji ebidola nyocha ihe gara na Zamfara steetị Enyere aha ha ka: Halilu Garba nke a na-etu 'Mabushi', Zubairu Marafa nke eji 'Wakili' mala na Nafiu' Badamosi nke bụ 'Zakiru'. Moshood Jimoh nke na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ndị a na-enye ndị uweojii aka na nyocha ha na-eme. Nke a pụtara ka onyeisi ndị uweojii zipụrụ ngalaba ọhụrụ atọ maka inyere aka kwado udo na nchekwa n'ime obodo Birane. Echere na mwakpo ahụ gburu ihe ruru mmadụ iri n'anọ bụ ndị n'ezu ohi ehi mere ya Ndị uweojii sị na ha ga-aga ụlọịkpe ma nyocha ha na-eme ugbua gwụcha." afirika-45476911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45476911,#Nike: Kaepernick akpanyela ọkụ n'ịntanet,"Dikaa ụfọdụ ndị ọcha ndị Amerịka ji iwe agba ak[ppụkpọukwu Nike ha nwere ọkụ ji gosi iwe ha ebe Nike nọ, ụlọrụ ahụ na-emepụta akpụkpọụkwụ na ngwahịa egwuregwu ndị na-aga ahịa dịka akara ọkụ.","Ihe butere iwe nke mere ndị Amerịak jiri ịnụọ iyi #Nikeboycọtt bụ na ụlọrụ ahụ jiri onye ọgba bọọlụ ama maka ikwugide ịkpa oke agbụrụ nakwa mwakpo ndị uweojii bụ Colin Kaepernick mee ozi azụmaahịa. Iwe nke a mere ka onyeisi obodo(Mayor) Louisiana machie ngwahịa egwuregwu ndị Nike n'ụlọ egwuregwu dị na mpaghara ahụ. Mayor a bụ onye a kpọrọ Kenner Ben Zahn nke atọ gwara ndị otu booster clubs ka ha kwụsi ịzụ na iyi uwe ndị ụlọọrụ Nike mepụtara. Ozi si n'akwụkwọ ozi ahụ, o kwuru na uwe ọbụla ndị otu a ga-eyi bụ nke onye Diretọ na-ahụ maka egwuregwu ga-etinye aka na ya. ụfọdụ ụlọakwụkwọ machịkwara ihe ọbụla si n'aka Nike. Mana dịka nke a na-eme, ngwahịa egwuregwu sị Nike bidoro rewe ka akara ọkụ n'elu intanet. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi a, Onye a kpọrọ starttoday kwuru na ọ ga-amalite inwe mmekọ n'ebe Nike nọ. Tish Peariman jụrụ na ọ bụ Mayor ga-ekpebi ihe ndị obodo chọrọ? Dufu Rigamaroll kwuru ga-achụpụ onye Mayor ahụ tupu ọmachie ntuliaka." afirika-46100149,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46100149,Kwụọnụ ndị ụlọomeiwu Imo N8m - Anunihu,Akụkọ dị mkpa taa Ụlọomeiwu Imo steeti,"Rochas Okorocha na ndị pati ya bụ APC na enwe ọgbaghara n'Imo steeti Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ụlọikpe akagbuola nkwụsị ọrụ n'ike a kwụsịrị mmadụ ise nọ n'ụlọomeiwu nke Imo steeti, ma kwuo ka ha laghachị ọrụ ozugbo. Ọkaikpe Goddy Anunihu kwukwara ka a kwụọ mmadụ atọ n'ime ha nde asatọ. Ndị omeiwu ihe a metụtara bụ Chiji Collins, Nkenna Nzerue, Uche Oguwuike, Israel Nnataraonye nakwa Donatus Onuigwe. Cheta na mmadụ ise a kpụpụrụ Gọvanọ Rochas Okorocha na Acho Ihim bụ onyeisi ụlọomeiwu nke Imo steeti, ụlọikpe n'ọnwa Julaị gara aga, ka a kwụsịrị ha ọrụ n'ihi ihe a kpọrọ akpaghị agwa kwesịrị onye omeiwu, nke Bekee kpọrọ ""un-parliamentary conduct"". N'akụkọ ọzọ, Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC, ekwuola na ọ bụ naanị ndị na-efe ala nna ha otu afọ, ụmụakwụkwọ mahadum gọomentị etiti nakwa ndị ọrụ bekee na-arụ na ngalaba gọomentị etiti ha ga-eji aka ha họrọ, ka ha ga-eji duzie ntuliaka 2019. Na mba ofesi, Ndị ntọ mmadụ tọrọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ gụnyere ụmụakwụkwọ Presbyterian sekọndarị n'obodo Bamenda dị na Kameroon taa. Ndị ụlọụka Presbyterian nwe ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụ ndị chọrọ iji aka ha achị onwe ha Bekee kpọrọ Separatists, tọrọla ha. BBC Pidgin nwetara ihe nkiri gosiri ka a nwụbara ụmụaka ahụ n'ime otu klaasị. N'egwuregwu, Aka na-echere Naịjirịa bọolụ bụ Francis Uzoho, agaghị eso ndị otu ya gbaa asọmpi dị n'etiti Naịjirịa na Saụt Afrịka ụbọchị 17 nke ọnwa Novemba, 2018. Uzoho kwuru na o nwetara mmerụ ahụ ga-eme ka ọ ghara isonye n'egwu ruo mgbe izu anọ gachara. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ka ndị Imo steeti chere aka ịghọrọ onye ga-efe ọkọrọtọ APC na 2019, FCC Jones Onwuasoanya bụ ọnụ na-ekwuchitere APC n'imo steeti kpọkuru ndị niile zọrọ ọkwa n'aha pati ha ka ha bịkọta ọnụ. Imo APC primaries: 'Pati ka a na-atụrụ vootu ọbụghị mmadụ'" media-49779820,https://www.bbc.com/igbo/media-49779820,Arsenal vs Aston Villa: Arsenal azaala 'nna m agụ' taa,Aston Villa bịara n'ụlọ ndị Arsenal kpaa ha aka n'ọdụ mana Arsenal gosiri ha ihe o ji bụrụ nna m agụ.,"Arsenal si n'azụ were ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Aston Villa n'asọmpi nke taa. N'isi ụtụ ihe dịka nkeji 20 ka ndị Aston Villa gbara aka ahịa ma nye Arsenal goolu nke si n'aka J. McGinn. Dịka ọgụ a na-aga n'ihu onye bụ A. Maitland-Niles kotere ụka mere ogbu bọọlụ ji chụpụ ya na nkeji 41. Arsenal nwetere ohere penariti nke N.Pepe nyere ha goolu na nkeji 59. Mana Aston Villa zaghachịrị mgbe Wesley nyere goolu nke abụọ ha na nkeji 60. Nke a gbawara Arsenal obi mere ha ji were iwe nye goolu abụọ na nkeji 81 na 84 site n'aka Calum Chambers na Pierre-Emerick Aubameyang. Mmerie a mere ka Arsenal bụrụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ Premier League. Man City azọọla Watford aja Ndị n'ọchị ndị n'akwa O dị otu Watford ka nrọ taa dịka otu Manchester City ziri ha egwu mmọnwụ. City kụnyere ha isi agba okpu mgbe ha nyere goolu asatọ asataghị otu n'asọmpị ha taa. Ihe ịtụ anya ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ na goolu ise n'ime ha bụ n'ime nkeji 18 ka enyere ha niile. Etu e si nye goolu ndị a bụ Bernado Silva na nkeji 1, Sergio Arguero na nkeji 7, Riyad Mahrez na nkeji 12, Bernado Silva na nkeji 15 nakwa Nicolas Otamendi na nkeji 18. Goolu ise ahụ bu etu e si mechi agba nke mbụ. N'agba nke abụọ, otu Watford kuliri n'ụra gbalịa ịnye goolu mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Kama ihe mere bụ na Bernado Silva gbawara ụzọ goolu ọzọ na nkeji 48 nakwa na nkeji 60. Kevin De Bruyne dọkaziri neeti ndị Watford kpam kpam na nkeji 85 mgbe o nyere goolu nke ya. Onye ma ka obi ga-adị onye nche bọọlụ otu Watford ugbua? Kedụ ebe Imo kwụ akwụ? Taa ka ụlọikpe ga-ekwu hoo haa onye meriri ntụliaka ọkwa Gọvanọ emere n'Imo n'ọnwa maachị. Dịka ọ dị ugbua ha na-emezi nchịkọta ikpe ahụ nke Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Hope Uzodinma gbara Emeka Ihedioha na-ekwu na mmeri ya ezighi ezi. Ọzọ, Allen Onyema Allen Onyema onye nwe ụlọọrụ AirPeace ekwuola na ha ga-aga ọzọ na mba Sawụt Afrịka bulata ụmu Naịjirịa ndị ọzọ ka chọrọ ịnata. O rụtụkwara ndị uweojii nke mba Saụt Afrịka aka kwuo na ha na-ada agbachi nkịtị ma a na-emebisi ihe ụmụ Naịjirịa n'ihi Xenophobia. Na mba ofesi, Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara Gọọmentị mba Kongo akwadola iwepụta ọgwụ mgbochi ọrịa Ebola nke abụọ iji belata ofufe ọrịa ahụ. Orịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri n'otu site n'afọ 2014 rue afọ 2016. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile #FreeSowore: Ụmụ Naịjirịa agbrụọla ihu maka ebubo eboro Sowore Omoyele Sowore Gọọmentị etiti agbaala Omoyele Sowore akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo ya ebubo ibupu ego na nzuzo nakwa ịchọ ịkwatụ ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. Ha kwukwara na Sowore kparịrị Buhari na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ mere mgbe gara aga. Sowore bụ onye nwe ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters'. O sokwa zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a n'otu Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru: @Omojuwa kwuru na nwuchi Sowore bụ ihe ihere nye gọọmentị etiti. Oti egwu a ma ama bụ Adekunle Gold gosikwara iwe ya. @OgbeniDipo bụ onye ọka nkụzi kwuru na onweghi ihe ọjọọ ọbụla Sowore mere ma gwa gọọmentị etiti ka ha tọhapụ ya. @markessien kwuru na ọbụ sọ okwu ka Sowore kwuru. Ndị ọrụ uweojii nzuzo Naịjirịa a kpọrọ 'Department of State Services' (DSS) nwụchiri Sowore n'abalị abụọ nke ọnwa Ọgọst. Ihe e ji nwụchie ya bụ maka ịhazi ngagharịiwe nke ọ kpọrọ 'Revolution Now'. Sowore kwuru na ngagharịiwe ahụ bụ maka ọchịchị ọjọọ nke si n'aka gọọmentị etiti. Gọọmentị kwukwara na Sowore na Nnamdi Kanu na-akpa nkata ịchutu ọchịchị Buhari Cheta na ụlọikpe enyebuola ikike ka ndị DSS jide Sowore ruo abali iri anọ na ise. Mana ka ọgachara abalị iri ise Sowore nọrọ na mkpọrọ, gọọmentị etiti agbaala ya akwụkwọ. Gọọmentị boro ya ebubo na o ji ụzọ aghụghọ zipu ego dị dọla 74,400. Ha kwuru na o zipuru $19,975 n'ọnwa Eprel, zipu $20,475, n'ọnwa May, zipu $16,975 n'ọnwa Jun, ma zipukwa $16,975 ọzọ n'ọnwa Julaị 2019. Ọzọkwa, gọọmentị kwuru na Sowore chọrọ iji ngagharịiwe 'Revolution Now' wee chutuo onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị Mmechi 'border' na-amịta mkpụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na mmechi emechiri oke ala Naịjiria na mba ndị ọzọ gbara ya okirikiri na-amịta mkpụrụ. O kwuru nke a mgbe ụfọdụ ndị ma ihe ekwe n'akụ maka azụmahịa bịara leta ya n'Abuja ụnyahụ. Ndị ahụ gụnyere otu 'Nigerian Association for Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture (NACCIMA) na ndị otu 'Federation of West African Chambers of Commerce and Industry (FEWACCI)'. Buharị kọwara na oteela aka Naịjiria jị arịọ arịrịọ ka mba ndị gbara ya okirikiri gbochilata mbubata ahịa adigboroja nakwa ntụbata ngwaahịa n'ụzọ ezighi ezi. Mana mmechi 'border' bụ iji wee gbaa ụzọ owere mgba ka o wee chie. Iwe Gbajabiamila Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila agbarụọla ihu etu ndi isi ọrụ nchekwa ụfọdụ siri gbajọọ ọgbakọ ọ kpọrọ iji chọọ ụzọ a ga-esi wulite nchekwa na Naịjiria. Gbajabiamila kwuru na ọ gbara ya gharịị etu ndị isi agha, nke ndị agha ụgbọelu na nke ndị ụgbọmmiri si hapụ ịbịa ọgbakọ ahụ kama zite ndị nnọchịanya. N'okwu ya: ""Nke a gosiri na onweghị ihe ha ji ụlọomeiwu a kpọrọ."" ""A ga m akọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ihe a ka ọ mara etu a ga-esi lebaa ya anya."" Gbajabiamila rịọrọ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka mbata ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Muhammad Babandende mgbaghara. Ọ chụghachiri ndị bịara ịnọchite anya ndịisi ndị agha, ma yigharịa ọgbakọ ahụ ka ọ dịzie ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Sepụtemba. Amerịka ga-aga Saụdi Onyeisi ndịọrụ nchekwa Amerịka bụ Mark Esper na onyeisioche otu jịkọrọ ndịagha Amerịka bụ Joseph Dunford Mba Amerịka ekpebiela na ha ga-eziga ndị agha ha na mba Saụdi Arebia dịka a tụrụ ogbunigwe abụọ na ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbidi na mba ahụ. Dịka onyeisi ọrụ nchekwa Amerịka bụ Mark Esper si kwuo, ọrụ ndị agha ahụ ga-abụ ịga gbochi ọgbatauhie. Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi ndị agha mmadụ ole a ga-eziga njem ahụ. Amerịka na Saụdi Arebia na-ebo mba Iran ebubo maka ịtụ ogbunigwe abụọ ahụ, mana otu ndị oyi egwu a kpọrọ Houthi rebels sị na ọ bụ ha tụrụ ya. Mourinho ọ ga-aga Real Madrid Jose Mourinho Onye nkuzi a ma ama bụ Jose Mourinho agwala ndị mmadụ ka ha ghara ịkpọ ya aha gbasara ịnaghara Zinedine Zidan ọrụ na Real Madrid. Mourinho gwara ụlọọrụ ntaakụkọ dị na Spen a kpọrọ Deportes Cuatro na Zidan abụghị onye a ga-eleda anya ma abịa na nkuzi bọọlụ. O kwuru na agbanyeghi otu ihe si kwuru na ihe ajọghị njọ n'otu bọọlụ Real Madrid ugbua dịka ndị mmadụ si eche. Ọ kọwakwara na ihe ka ya mkpa ugbua bụ ịmụta asụsụ Jamini maka adịghị ama ama o nweta ọrụ na mba ahụ n'ọdinhu. Asụsụ Jamani ga-abụ asụsụ nke isii Mourinho ma asụ. Gee nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Gịnị bụ 'Cricket' n'asụsụ Igbo?" afirika-50266108,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50266108,Electrical Engineering: 'Na nrọ ka e ziri m etu e si arụ igwe ọkụ latrik',Solomon Ukoha so n'ime ndị nwere akara aka ịrụpụta akụrụmgwa technuzu.,"Dịka ụfọdụ mmadu n'Aba, Maazị Ukoha enweghị ohere ịga mahadum mana ọ na-agbalị ike ya n'imepute ihe. Ọ sị na ọ bụ na nrọ ka uche oji eme ihe ọ na-eme si apụta. N'ihe nkiri a, o gosiri aka ọrụ ya ma kwukwa ebumnuche na olilanya ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49276181,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49276181,Sowore: Ụlọikpe enyela DSS ijide ya na mkpọrọ ha ruo abalị 45,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja anabatala ekpere ngalaba nchekwa Naịjirịa akpọrọ ""Department of State Security"" (DSS) ka ha jide Omoyele Sowore ruo mgbe ha mechara nyocha ha.","Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Ka ikpe malitere taata, DSS wetere ihe nkiri gosiri Nnamdi Kanu na Sowore ebe ha na-eme nzukọ nakwa nke gosiri ebe ọ na-agwa ndị otu Shia ka ha sonyere atụmatụ Revolution Now iji kwatuo gọọmentị Naịjirịa. Ọkaikpe Taiwo Taiwo sị - ka ọ nyochachara akaebe DSS nakwa ihe odidie ha wetere - na mkpụrụ okwu Bekee ""May"" ha tinyere gosiri usoro, nke mere o ji nye ha ohere ijide ruo Abalị 45 ahụ. DSS sịbụ ka enye ha ohere ijide Sowore ruo abalị iri itoolu mana ụlọikpe nyere ohere abalị iri anọ n'ise. Okwu a ga-alachite ụlọikpe n'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba. Cheta na Sowore hibere atụmatụ Revolution Now nke gọọmentị si na omegidere iwu ọha nke metụtara ịkpa nkata megide obodo." afirika-44284820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44284820,Naịjirịa na Kongo agbaala otu n'otu n'asọmpi enyi na enyi,"Ka Naịjirịa na Kongo zutere onwe ha taa, olileanya ndị kwụ ha n'azụ bụ na mmeri ga-erute ndị nke ha aka.","Ndị Eagles nwere olileanya na ha ga-eme ọfụma na Roshịa Ndi ihe a kachasị metụta bụ ndị Naịjirịa makana ha na-ahụ asọmpi a ka ihe ndị Super Eagles ga-eji kwado iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ụbọchị ole na ole na-abịa. Ka asọmpi ahụ bidoro, ọ dị ka ndị Super Eagles ga-enwere ụbọchị ka Troost-Ekong gbakara ọnụ goolu ndị Kongo na nkeji 14. Mana, Kongo jiri penariti nye goolu nke ha n'elekere 78. Ngulubi tọghapụrụ ochegoolu Eagles bụ Uzoho were nye goolu ahụ. Nke a mere ka ha gbaa onwe ha onye lawa onye lawa." afirika-49119397,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49119397,Man Utd agwala Tottenham na akpụkpọụkwụ nwere 'size',Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United edulaala Tottenham na asompi enyi na enyi ha gbara taa.,"Asọmpi a, a kpọrọ ""International Champions Cup"" n'asụsụ Bekee, bụ nke e ji akwado maka mmalite afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ. Anthony Martial bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 21. Mana Lucas Moura mere garagara saa ya n'agba nke abụọ. Ka nkeji 80 na-akụrụ ọnụ, Angel Gomez nyere goolu ọzọ wee sị Tottenham taa kpuchie ọnụ. Mana obi gbawara ndị Manchester oge e bupuru onye otu ha bụ Eric Bailly maka ahụ o merụrụ." afirika-50094915,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50094915,'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra',"Ụmụnne Dick Tiger kwuru maka mbọ ọ gbara were pụta ihe dịka dike na dimkpa, nakwa ka o si nye aka n'agha Biafra.","Ha kwuru na ya bụ nwaamadị tara ahụhụ nke ukwuu tupu ọ pụta dịka dike na dimkpa Igbo. O rere ololo mkpọ (karama) n'Aba tupu ọ malite ịkụ ịgbakwụ. Mgbe o merichara ọkpọ na Naịjria, ọ gara Briten ichere ndị ọcha aka mgba. Ọ dịghịrị ya mfe mgbe o ruru ebe ahụ. O mechara nwee obi ịdamba tupu Chi Igbo agbakwute ya. Mgbe ahụ ka ọ malitere ịkụpụ ndị ọcha mkpụru ọkwụru n'anya. Lee akụkọ a ka ị hụ ka o si gaa. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46819764,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46819764,Asuu Strike: Ndị nkụzị mahadum ka kwụkwa ebe ha kwụ,"Uche ọtụtụ ndị mmadụ bụ na gọọmentị etiti na ngalaba na-ahụ maka ndị nkụzị mahadum na Naịjirịa enwela nkwekọrịta ga-eme ka ụmụakwụkwọ laghachịe ụlọakwụkwọ ha, mana ihe na-ebe ka na-ebe kwa.","Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Nke a pụtara ka ndị Asuu anabataghị nkwa gọọmentị etiti kwere ha mgbe ha nwere nzukọ n'izu a. Nzukọ ahụ bụ nke asaa gọọmentị Asuu na gọọmenti etiti na-enwe maka okwu abụbụ ọru ndị Asuu na-eme. N'ụbọchi Tusde nke ọnwa Janụwarị 2019, Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru na gọọmentị etiti na Asuu na-abịa nso inwe nkwekọrịta. Mana, dịka ọkwụ ugbua, Asuu na-akọwa na ha ekweghị n'atụmatụ gọọmentị. Nke pụtara na mgbape mahadum dị iche iche ka nwereike bụrụ ihe a na-anụ n'akụkọ mana agaghi ahụ n'anya na nso nso. Na mkaprịtaụka Asuu na ụlọ ntaakụkọ Premium Times nwere, onyeisi ha bụ Biodun Ogunyemi sị na ọ bụ ndị otu ya kwuru na ha anabataghị nkwa gọọmenti kwere. Ọ gakwara n'ihu gwa ndị Premium Times na ọbụghi eziokwu na gọọmentị enweghị ego ha ga-eji mezuo ihe Asuu chọrọ. BBC Igbo kpọrọ Ogunyemi ịnụta n'ọnu ya mana ọzaghị ekwenti ya. BBC zigakwara ya ozi na SMS, mana ọ sabeghi tupu akụkọ a pụo." afirika-53471181,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53471181,"Oji River killing: 'Ndị ọchị ehi gbuchara nna m, ụjọ ịga n'ugbo ji anyị ugbua'- Nwada e gburu nna ya",Ndị be Eugene Iloabani bụ nwoke a na-eche na ọ bụ ndị ọchị ehi gburu n'ugbo ya ka nọ n'anyammiri.,"Ha kwuru na ụjọ ji ha ugbua ịga ugbo nke mere na o nweghị ihe oriri ha na-enwetezi n'ugbo ha. Ha kwuru na ruo ugbua, na kọmishọna uweojii Enugwu steeti kwere ha nkwa ịchọpụta ndị kpara arụ a, agwabeghị ha ihe ọbụla. Ebere Iloabani bụ ada ya, kwuru na ọ bụ ọrụ ugbo a ka nna ya ji azụ ụmụ ya niile. Ha na-arịọ ka gọọmentị gwa ndị ọchị ehi ka ha kpọrọ ehi na atụrụ ha laghachi be ha. Gee ihe o kwuru n'uju:" afirika-48659513,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48659513,EU EOM Report: Ihe asaa ndị a kwuru gbasara ntuliaka 2019,Ngalaba nlete ntuliaka otu jikọtara mba nilie dị na Yurop akpọrọ European Union (EU) na Bekee hibere adụọla gọmenti Naịjirịa ọdụ ka ha kpachapụ anya ma gbanwee ọtụtụ mperi o riri na ntuliaka nke 2019 ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iwulite ochịchị onyekwuouche ya n'ọdinihu.,"Umunwanyi na-egosi akwụkwọ ntuliaka ha na Ọka, Anambra Steeti Ngalaba a akpọrọ EU Election Observation Mission (EU EOM) bịara leba anya na ntuliaka e mere na Naijiria na Febuwari nakwa Mach 2019 nyere ndụmọdụ a oge ha wepụtara akwụkwọ ozi ha iji gosi ihe ha nyochapụtara oge a na-eme ya bụ ntuliaka. Ha kwuru na ntuliaka 2019 jupụtara n'ọgbaghara nke ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasịnụ na Naijiria kpatara ya, kwukwaa na ebe ndị ụfọdụ, ndị orụ nchekwa ekweghi ha na ndị ntaakụkọ ndị ọzọ rụọ ọrụ ha otu okwesiri. Onyeisi ndị uweojii na Anambra biara leta ụlọọrụ ndị INEC a gbara ọkụ n'Awka Ha kwukwara na ngalaba na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naijiria bu INEC kwesoro ka gọọmenti kwadosie ya ike iji mee ka kwudoro onwe ya ma nwee ikike ihazi ntuliaka n'ọdịnihu n'ụzọ kwesiri ekwesi. Maria Arena bu onye isi ndi otu EU ahụ biara nyochaa ntuliaka 2019 kwuru na mgbanwe ndia kwesiri ka gọọmentị gbaa mbọ mee ha ngwa ngwa tupu oge ntuliaka ọzọ eruo na 2023. bu onye isi ndi otu EU Maria Arena, onye isi ndi otu EU EOM na Naijiria na Adamu Mohammed, onye isi ndi uweojii na Naijiria Lee ndụmọdụ asaa ndị EU EOM nyere gọọmentị Naijiria. 1. Ikwadosi INEC ike iji mee ka usoro mkpokọta mpụtara ntuliaka buru nke pụtara ihe nakwa nke ndị ọha obodo ga-atụkwasị obi. 2. Imeputa iwu ga-akwado ụzọ ịme ka mputara ntuliaka bụrụ nke ghe anya oghe nakwa nke na-agaghị ahịa ahụ nnweta. 3. Ikwadosi INEC ike n'usoro ha si eme ihe nakwa usoro mgbasa ozi n'ime onwe ha. 4. I me ka ngalaba na-ahu maka nchekwa oge a na-eme ntuliaka rụọ ọrụ ha otu okwesiri n'ụzọ pụtara ihe na-enweghi onye ọbụla ha gụpụrụ. 5. I me ka ọbụrụ iwu na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga enwe ọnụọgụgụ ụmụnwanyi ha na-ewepụta i so zọọ ọchịchị. 6. I me ka ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka na-ekpebikwa ikpe n'ihe ndị meburu tupu amalite ntuliaka. Nkea ga-egbochi ndị mmadụ ibupu okwu n'ụlọikpe di iche iche n'otu oge. 7. Ị gbanwe usoro e si enye ikike mgbasa ozi i ji mee ka ndị ụlọọrụ ntaakụkọ nwee efe igbasa ozi ha nke ọma ma gosipụta ndịịche nile e nwere na Naijiria. Maka asisa ihe ndị a EU EOM kwuru, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye gwara BBC na ha ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu mgbe ha natara akwụkwọ nchọpụta ngalaba National Demcratic Institute na International Democratic Institute na ewpụte maka ntuliaka 2019. ""A ga-enye anyị akwụkwọ ndị a taa. Mgbe ahụ ka anyị ga etinye ọnụ n'okwu a, ma chịkọta ya ọnụ."" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49398180,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49398180,Water Generator: Emeka Nelson rụpụtara igwe ọkụ ji mmiri arụ ọrụ,Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba.,"Ọ sị na ya na enyi ya nwoke malitere ịrụpụta igwe latrik, mana anwụrụ igwe ọkụ latrik gburu enyi ya n'ụra. Ọ gbara mbọ hụ na o metọpụrụ igwe a ebe ha kwụsịrị. Emeka kwuru na o riri ya puku narị naịra abụọ n'irụcha. Akụkọ ga-amasị gị:" 46303154,https://www.bbc.com/igbo/46303154,International Literacy Day: Asụsụ Igbo na-eme ka ụmụaka ghọta 'Maths' ọfụma,Taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Sepụtemba bụ ụbọchị eji echeta agụmaakwụkwọ kwa afọ iji chetara ndị mmadụ uru ọ bara ị gụ akwụkwọ.,"Ọ bụ ngalaba akpọrọ 'United Nations Educational ,Scientific and Cultural Organisation' kewapụtara ụbọchị a ka otu dị iche iche lebaanya na nsogbu a na-enwekarị n'ihe gbasara agụmakwụkwọ. Isiokwu nke afọ a bụ agụmakwụkwọ n'asụsụ dị iche iche. Ihe nkiri ọzọ ga-amasị gị: Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ - Onye nkuzi kpuruisi Mgbakọ na mwepụ a na-ara gị ahụ? Kirie ka nwaanyị a si eji asụsụ Igbo akụziri ya ụmụaka a. Cynthia Adaeze Chinule kwuru na ọ chọpụtara na ụmụaka o ji asụsụ Igbo akụzirị mgbakọ na mwepụ na-aghọta ya karịa mgbe e ji asụsụ Bekee kuziere ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49615332,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49615332,Xenophobia Attacks: Anyị na ndị South Africa bụ nwanne - Nuella Njubigbo Chikere,"Nuella bịara n'ụlọọrụ BBC Igbo sonye na mkparịtaụka a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ' ebe ọ nọ kwuo uche ya gbasara okwu a kpụ n'ọnụ, ndụ ya nakwa ihe na-eme na Nollywood.","Ọ zakwara ajụjụ ndị ọzọ gbasara ezinaụlọ ya dịka akụkọ na-efegharị maka di ya bụ Tchidi Chikere. Mgbe a jụrụ ya ajụjụ gbasara kepukepu na di ya gbaghapụụ onye ọ na anụbu lụwa ya, ọ sara sị, ""unu ga-akpọta Tchidi n'onwe ya jụọ ya maka nke ahụ"". N'akụkọ gbasara Xenophobia, o kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị Afrịka niile kwesiri ịbụ nwanne anaghị ahụ onwe ha etu ahụ. ""Ya bụ ihe jogburu onwe ya ka o kwukwara"" ka Nuella kwukwara. O ji kwa ohere ahụ zara ọnụ ndị ibe ya na-eme ihe ejiije na Nollywood gbasara ebubo mmefu akụ onye ọzọ a na-ebo ha. Ọ kọwara na ndị ọrụ ejije nwekwara aka ọrụ dị icheiche ha ji enweta ego n'akụkụ nke Nollywood ha na-eme. ""Ọ bụghị mmadụ niile ga-agwa gị ọrụ ndị ha na-arụgasị n'akụkọ iji kwalite ego ha"" ka Nuella gwara anyị. Gee ihe ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo ebe a." afirika-43956085,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43956085,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Imo na Delta ga-enwe ọdọ mmanụ agbidi,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,Imo steeti na Delta steeti esonyela na steeti ebe a ga-enwe ọdọ na-arụpụta mmanụ agbidị na Naịjiria. Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu bụ onye kwuru nke a ebe a na-agbape ọdọ ọhụrụ na Bayelsa. O kwukwara na ihe a ga ewetara ndị ntorobia Naịjirịa ọrụ. N'ebe ọzọ... Otu ụlọịkpe amaala onye ọkaiwu bụ Joseph Nwobike so na otu ndị ọkaikpe akpọrọ SAN n'aha ịchafụ ikpe maka ebubo mgbochi ikpe zuru ezu. E nwereike ị napụ ya ịkịke ị bụ onye ọkaịwu ukwu maka okwu a dịka esi mee Emeka Ugwuonye n'oge gaara aga. Na mba ndị ọzọ: Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buahrị na onyeisiala mba Amerịka ga-enwe mkparịta ụka ma ha mechaa nzụkọ ịme ụlọ ebe 6:30 nke mgbede a Cheta na Buahri gara njem ị leta onyeisiala mba Amerịka taa N'egwuregwu Otu Rangers nke Enugu nwere ike ị ku-ume ugbua ebe ha ji ọkpụ ato asataghị otu merie Wikki Tourist nke kwara ụnya ahụ Mmeri a ebugola ha n'ọkwa ise na NPFL nke Naịjiria. Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma: Otu onye ntaakụkọ BBC anwụọla na Afghanistan. Ahmad Shah dị afọ ịrị abụọ n'ịtoolụ nwụrụ mgbe a wakporo ebe ọ nọ n'obodo Khost na Afghanistan. Ndị isi na BBC ka na-enyocha ka a mara ihe mere n'okwu a. Gee nkeji nke mgbede a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe afirika-45236092,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45236092,Portharcourt: Ọgbaghara adaala na ntuliaka ha mere,Ogbagbara mere na ntuliaka ndị Rivers steeti,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọgbaghara adaala na ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchi anya obodo Portharcourt n'ụlọome iwu ndị Rivers Steeti. Akụkọ a kwuru na ndị akpụ obi ji egbe maburu igbe eji eme ntuliaka, ebe ndị pati APC na PDP na-ebo onwe ha ebubo n'ihe butere ọgbara ahụ. Ndị mmadụ na-eri uju ọnwụ Kofi Annan Otu United Nation, mba Gana nakwa ụwa niile na-eri uju n'ọnwụ onye odeakwụkwọ United Nation n'oge gara aga bụ Kofi Annan. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'okwu iti aka n'obi ya kwuru na Kofi Annan bụ nwoke dị umeala ma hụkwa mmadụ n'anya. Ndị uweojii anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob Ndị uweojii nwụchiri ụmnwaanyị Ipob na-eme nghariiwe n'Ọgọstụ 17,2018 n'Owere isi obodo Imo steeti Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị na-eme ngagharị iwe n'Owerri ụnyaahụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Andrew Enwerem kwuru na onweghi onye nwụrụ oge ha na-anwụchi ụmụnwaanyị ndị a. N'Egwuregwu: Otu FIFA ajụla atụmatụ njem nleta minista egwuregwu bụ Solomon Lalong chọrọ ime n'isi ụlọọrụ ha dị na Switzerland. Otu egwuregwu bọọlụ dị na mba spen ga-amalite asọmpi La liga Santander nke afọ 2018 banyere 2019 n'abalị a. Gee akụkọ anyị nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị" 42696302,https://www.bbc.com/igbo/42696302,Ọchị ehi na Benue: 'Aga m emezu iyi ọrụ m' - Buhari,Onye isi ala bụ Muhammadụ Buhari na dị ọnụ na-eru n'okwu na Benue steeti emechaala ọgbakọ ha nwere n'Abuja taa.,"Buhari na ndị ya na ya nwere ọgbakọ ya na ya nwere ọgbakọ Ọgbakọ ahụ bụ iji chọta ụzọ kachasị mma iji kpezie esemokwu dị n'etiti ndị obodo Benue na ndị ọchụ ehi nọ na steeti ahụ. Na ngwụcha ọgbakọ ahụ, onye isi ala Buhari kwuru site n'akara ya na twitter na ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa niile nọ na Naịjirịa ga-agbasi mbọ ike iweta ya bụ esemokwu n'isi njedebe. End of Twitter post, 1 Buhari na ndí Benue n'ogbako" afirika-56807655,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56807655,Lee nwoke tinyere ịgba boy ndị Igbo na Mahadum Harvard,Ndubisi Ekekwe bụ Ọkankuzi n'ihe gbasara igwe kọmpụta.,Ọ kọwarala BBC Igbo ihe kaplitere mmụọ ya iji gbaa mbọ tinye ịgba boy bụ ihe eji mara ndi Igbo na Mahadum Harvard. Gee okwu ya n'uju ebe a: egwuregwu-48084079,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48084079,Leicester City vs Arsenal: Aṅụọla Arsenal ka 'akpụrụ achịa',"Ohere Arsenal nwere iji soro n'asọmpị ""Champions League"" nke ""season"" ọzọ nọzị n'elu ka Leicester City ji ha mee nrị ehihe ka ha zutere na ""Premier League"".","Youri Tielemans nyere goolu ya nke anọ na Leciester Ya bu ọdachi bịakwụtere ha n'ọgbọ egwuregwu King Power Stadium nke Leicester City. Agbanyeghị na njem Champions League nọ n'elụ akwa, Arsenal ahụghị ụkwụ ha jị agba bọolụ ka Leicester jị ọkpụ goolu atọ asataghị otu mee ha akaja. Agbanyeghị na-ewepụrụ otu onye Arsenal bụ Ainsley Maitland-Niles akwụkwọ ọbara ọbara. Nke bụ ugboro atọ n'otu ahịrị apịaturu Arsenal na Premier League. Ugbua, ha na-achụ Chelsea n'azụ bụ ndị ga-ezute Manchester United taa." afirika-54797713,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54797713,"US Election 2020: Donald Trump, George Bush... Lee ndị niile chịrị Amerịka naanị otu 'term'","Mmiri ntuliaka ọkwa onyeisiala Amerịka ezochaala gbachaa, mana otu ihe doro anya bụ na ọkụ Donald Trump dịka onyeisiala mba ahụ anyụọla.","Otu ihe si kwụrụ ugbua, n'abalị iri abụọ nke ọnwa Janụwarị afọ 2021 ka a ga-edu Joe Biden n'iyi ọrụ dịka onyeisiala. Mana ọ bụghị Trump ga-abụ onye mbụ chịrị Amerịka naaị otu 'term'. Ndị niile chịrị Amerịka naanị otu ugboro Gerald Ford, Jimmy Carter, George HW Bush bụ ndị chịrị Amerịka naanị otu ugboro kamgbe afọ 1933 1) George Bush:- Onye ikpeazụ na-emerighi ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka nke ugboro abụọ bụ George HW Bush. Bush, onye nọ na pati 'Republican' gbalịrị ike ya, mana ihe ọ nọrọ n'oche Onyeisiala bụ naanị afọ anọ tupu Bill Clinton akụchapụ ya n'ụzọ. Ọchịchị ya malitere n'afọ 1989 ruo afọ 1993 tupu ndị Amerịka agbaara ya ụgbọnwamkpi. 2) Jimmy Carter:- E nwere ike ikwu na mba Iran so na ndị mere Carter emerighi ntuliaka nke abụọ ya dịka onyeisiala. Ọchịchị Carter malitere n'afọ 1977 ruo 1981 tupu Ronald Reagan emerie ya. Ihe kacha gbuo ọchịchị Carter bụ oge mba Iran nwuchiri ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ nnọchite anya mba Amerịka dị na mba ha. Mbọ niile Carter gbara ịgbapụta mmadị iri ise na abụọ (52) ahụ Iran nwuchiri enweghị isi. Ọ bụ n'ụbọchị Carter rituru n'ọchịchị ka Iran tọhapụrụ ndị ahụ. 3) Gerald Ford:- Ihe Amerịka mere Jimmy Carter bụkwa otu ihe ha mere Gerald Ford. Ford chịrị malite n'afọ 1974 ruo 1977. Herbert Hoover, William Howard Taft na Benjamin Harrison socha na ndị chịrị Amerịka otu ugboro naanị. 4) Herbert Hoover:- Hoover bụ onyeisiala nke iri atọ na otu na mba Amerịka. Ọchịchị ya malitere n'afọ 1929 ruo 1933. Onye chụturu ya n'ọchịchị bụ Franklin Roosevelt, onye chịrị Amerịka 'term' atọ chara acha tupu e megharịa akwụkwọ iwu mba ahụ. Ndị ọzọ Ndị ọzọ chịrị Amerịka naanị otu ugboro gụnyere: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 60 na-eme ngagharịiwe nke udo maka Biden na New York Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị uweojii anwụchiela mmadị iri isii bụ ndị so eme ngagharịiwe nke udo na New York n'abalị ụnyaahụ. Dịka ngwụcha ntuliaka mba Amerịka na akpụdebe nso, ndị nkwado Joe Biden nke Democrat emeela ngagharịiwe na New York na-arịọ ndị ọchịchị ka ha gbaa mbọ gụchaa vootu niile. New York times dere na ndị uweojii ekeelarị nkwụkwụcha maka nsogbu ọbụla ga-adapụta n'etiti ndị nkwado Trump na nke Biden dịka mpụtara ya bụ ntuliaka ha mere na-eteziaka. Ndị uweojii gakwuru ọtụtụ mmadụ pụtara ngagharịwe na Midtwon n'elekere asatọ na iri atọ (8:30 pm) bụ ebe ha chọrọ isi gawa Washington Square ga chụsaa ha. Ka ọ dị ugbua, Biden ji electoral vootu iri abụọ na itoolu aga Trump ebe ọ fọrọ naanị electoral vootu iri abụọ na asaa ka ọ nwezuo ole a chọrọ. Twitter machiri onyeisiala Trump izisa ozi gbasara ya Dịka ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala mba Amerịka na-akpọtụ, Joe Biden na Donald Trump ekwuola na obi kara ha n'ogogo mpụtara na steeti nke akpọpụtagoro. Ka ọ dị ugbua, Twitter amachiela Trump izipu ozi ọbụla gbasara nrụrụaka na ya bụ ntuliaka. Ndị Amerịka na-eme ntuliaka nke a na-ahụta dịka nke kachasị ekewa ndị mmadụ nke dị n'etiti Donald Trump nke otu 'Republican' na Joe Joe Biden nke otu 'Democrats'. Atụm vootu malitere n'elekere Ise na Vermont. Ihe ruru narị nde mmadụ bụ ihe tụọọla vootu ha nke na-eme ya ntuliaka akachasị nwee ndị pụtara tuo vootu n'afọ otu narị gara aga. Biden na Trump n'azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a kachasị nwee nkewa Mmadụ abụọ ndị a nọzị n'egwu egbe buru ọla na steeti ndị a ma dịka isi a hụrụ kwawa okpu n'ọsọ onye ga-emeri. Ngụọ ucheonye e merela na-egosi na ọ bụ Biden bu ụzọ mana ọ bụ ihe ọ bụ ihe onye chịtara na steeti ga ga-ebi okwu. Na ntuliaka mba Amerịka, ọ bụ ihe ndị mmadụ tụtara na steeti dị iche iche na-ekwu onye meriri , ọ bụghị onye meriri n'etiti kpọmkwem. Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị n'ụtụtụ ịtụ vootu ha n'ọnọdụ atụmvootu dị na Philadelphia, Pennsylvania Steeti ndị a ma dịka isi a hụrụ kwawa okpu n'ọsọ onye ga-emeri na ntuliaka ebe a malitere ntuliaaka na Tuzde gụnyere North Carolina na Ohio (11:30 GMT), Florida na-eso ha Florida. Pennsylvania, Georgia, Michigan na Wisconsin. Arizona balitere atụmb=vbootu nke ha n'elekere mbụ.( 13:00 GMT). Iji nweta ọkwa onyeisiala, onye na-azọ ya bụ ọkwa ga-enwetarịrị opekata mpe vootu 270 na ọgbakọ' 'electoral college'. Steeti ọbụla dị n'Amerịka nwere vootu ole ha na-eketa dịka ọnụọgụgụ ndị bi na ya siri dị. E nwere vootu 538 a na-achọ. Usoro a mere o jiri kwee ọmụme mmadụ inweta vootu kachasị na gburugburu ala Amerịka mana ọ gaghị emri na ntuliaka dịka o mere Hillary Clinton na ntuliaka afọ 2016. Ihe ọzọkwa a na-azọ na ntuliaka bụ ndị ga-achị ọgbọ n'Ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka dịka ndị otu ""Democrats' na-achọ ka ha weghara ma Ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka ma 'White House'. Okwu ọrịa Coronavirus bụ iuihe nọchiri achụmntavootu ntuliaka dịka ya bụ ọrịa kawanyere njọ dịka ntuliaka na-akpụdebe nso. Ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus nakwa ndị nwụrụ na ya bụ ọrịa na mba Amerịka kachasị nke ndị mba ndị ọzọ. Ọ bụ egwu nkesa ọrịa a mere e jiri malite atụmvootu nakwa iziga vootu site na postu ofisi n'oge . E doro aja ọhụụ n'ihu 'White House' dịka ụbọchị atumvootu kpudebere nso A na-atụ egwu na a ga-enwe tigbuo zogbuo ma mpụtara ntuliaka malite ịpụta. Ebe ka Biden na Trump mere achụmnta vootu ikpeazụ ha? Ụbọchị Mọnde, Onyeisiala Trump, onye gbara afọ 74, onye ka nọ n'azụ n-agbenyeghị na o nwere ike ịchịta vootu rinne na steeti anọ bụ 'ọbata-obie"" gara na North Carolina, Pennsylvania, Michigan nakwa Wisconsin, ebe ọ nọọ kwuo maka ihe o megara iji kwalite akụnaụba. Ọ nọkwara n'ebe ndị katọ ihe ngụkọ ucheonye(poll) na-ekwu, nụlọrụ ntakụkọ ma were kwa onye ya na-azọ ọkwa njakịrị. Ọ gwara ndị iihe ya na-amasị na Michigan na ""Anyị ga-enwetakwa afọ anọ ọzọ na White House"". Ma Trump ma Biden gara Pennsylvania,ebe ha bụọ na-esukọ isi Na Scranton bụ obodo Biden bi kemgbe ọ gbara afọ 10, Trump gwara ndị na-akwado ya na ya meriburu na mpaghara ahụ n'afọ 2016 na agbanyeghị na ngụkọ ucheonye kwuru na ọ gaghị achịta aja ebe ahụ. Otiegwu Lady Gaga soro Biden gbara afọ 77 na achụmtavootu o mere na Pittsburgh. Otiegwu John Legend na Kamala Harris bụ osote Biden gwara ndị mmadụ okwu na Philadelphia. N' Ohio, Biden gwara ndị mmadụ na oge eruola ka Trump""kwara ngwongwo ya"", sị na ""ike ozi ọ na-ewepụta na Twitter, iwe,akpọmasị na amaghị eme ya agwụla anyị."". Kedụ oge anyị ga-amapụtara ntuliaka a? Ọ ga-enwe otụtụ ụbọchị tupu a gụchaa vootu mana a na-ebido n'oge mata onye ga-emeli n'ụtụtụ ụbọchị na-eso ntuliaka. Ndọ ọrụ a dịị na-adọ aka na ntị na o nwere ike o wee oge karịa n'ihi na ndị pụtara tụọ vootu nke 'post office' dị ọtụtụ. Nani oge nke George W. Bush, bụ ntuliaka Amerịka e jighị ụtụtụ mara onye meriri dịka o were otu ọnwa tupu ụlọikpe Kachasị nyere mkpebi na ya.T Kedụ ebe mmadụ abụọ si dị iche na nkwa ha na-ekwe? Mmadụ abụọ ndị a adụọla aka n'ọnụ n'okwu gbasara Covid 19, dịka Trump na-ebo Biden ebubo ịchọ ịkwada akụnaụba mba ahụ. Biden n'onwe ya na-esi ọnwụ na ya kwudo na Sayensị dịka ọ na-ebo Trump ebubo na ọ lụghị ọgụ coronavirus ka o kwesịrị nke mere o jiri taa isi ọtụtụ ndị mmadụ. N'okwu akụnaụba, Trump chọrọ igbupi ụtụ na'a ana n'ego nnweta onye(income tax) ma nyekwa ụlọọrụ ego iji wants to deliver an income tax cut, and provide companies with tax credits to incentivise them to keep jobs in the US. Biden chọrọ ibuli ego ụtụisi ndị na-ata nnukwu ụgwọọnwa iji kwado ọrụ ọha mana o kwuru na ọ bụ naanị ndị ego ha ruru dọla 400,000 kwa afọ. Ọ chọkwara ka e bulite ụgwọ ọnwa opekata mpe ka ọ bụrụ dọla 15." media-46369262,https://www.bbc.com/igbo/media-46369262,Boko Haram Attacks: Nkwa Buhari kwere ndị agha na Maiduguri,Akụkọ dị mkpa Buhari wuchiri Borno taa,"Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem gaa Maiduguri ileta ndị agha Naịjirịa merụrụ ahụ n'ọgụ Boko Haram. N'okwu ya, Buhari sị na ọ na-akwanyere ha ugwu n'ihi aja ha na-atụ iji chekwa Naịjirịa ma rịọ ka mkpụrụobi ndị nwụrụ anwụ laa n'udo. Ọ gakwara n'ihu kwee ndị agha nkwa na ya ga azụta ngwa ọgụ ha ga-eji buso Boko Haram agha. End of Twitter post, 1 Ndị eche na ha bụ ndi ohi nara mụọ n'Aba Mmadụ abụọ a na-eche na ha bụ ndị ohi ezutela ọnwụ ha n'ike dịka ndị mmadụ ji iwe kpọọ ha ọkụ n'Ụmụngasị Aba dị n'Abia Steeti. Anya hụrụ ka ihe a ji mee kwuru na ndị a ji ọgbatutum nara otu nwaanyị ego dị puku narị naịra atọ na iri ise. Rọshịa onyere CAR ego n'efu? Mba Rọshịa ekwuola na onweghi ego dị injeri dọla iri na abụọ ha gbazinyere ndị Central African Republic kama nọ bụ mmehie igwe kọmpụta bipụtara aha obodo ahụ. Ọnụ na-ekwuru Central African Republic bụ Ange Maxime Kazagui n'otu aka ahụ gọnarịrị akụkọ ahụ na onweghi ego ọbụla ha natara. N'Egwuregwu N'asompi Uefa Champịọns, PSG ga-ezute Liverpool, Tottenham ga-anabata ndị Inter Milan. Barcelona na ndị PSV ga-achịpụkwa ya dịka Monaco, Galatasaray, Napoli, FC Porto na ndị ọzọ ga-ekere egwu. Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu patị PDP agaala ịhụ osoteonyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu maka ịkọwa ihe mere o jiri hopụta Peter Obi dịka osote onyeisiala ya. Atiku gwara Ekweremadu na ọ họpụtara Obi maka ọdịnma ndị Igbo. Cheta na akụkọ kwuru na obi mebiri Ekweremadu oge ọ chọpụtara na ọbụghị ya ka Atiku họpụtara dịka osote onyeisiala ya. Ihe Okorocha kwuru maka ndị obi mebiri na APC N'Imo steeti, gọvanọ Rochas Okorocha akatọọla onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole maka etu ntuliaka imeụlọ pati ahụ siri ga n'Imo steeti. Cheta na Oshiomhole kwuru na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ntuliaka imeulọ n'Imo steeti mana Okorocha ka na-ekwu na ọ bụ ọgọ ya bụ Uche Nwosu bụ onye nwere mmeri. Ọgụ agbaala ụlọọrụ kemikal na China N'ofesi, ọkụ agbaala otu ụlọọrụ na mba China na amụpụta mmiri kemical dị iche iche. Ndị gbata gbata kwuru na mmadụ ruru iri abụọ na abụọ bụ ndị nwụrụ na mberede a nakwa na ọtụtụ ụgbọala gbara ọkụ na mberede a. N'egwuregwu N'egwuregwu, ndị Super Falcons ejila penariti merie ndị mba Kamerun n'asọmpi agba nke anọ nke iko African African Women Cup of Nations agbara ụnyahụ. Falcons ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Kamerun ka nkeji iri itoolu na-agụcha. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'" afirika-48368226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48368226,NCAA strike: Ndị ọrụ ụgbọelu n'Enugwu esorola ndị ogbo ha gbaa abụbọ ọrụ,Otu na-ahazi ka ọrụ ọdọ ụgbọ elu si aga bụ NCAA na aha ịchafụ ngalaba nke Enugwu ekwuola na ha agaghị arụ ọrụ ọbụla ganye n'ụbọchị atọ agafee.,"Mgbe BBC Igbo gara n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu, ụlọọrụ ndị NCAA gbachiri agbachi ebe ndị ọrụ na-agagharị na-arụghị ọrụ ọbụla. Onyeisi ya bụ ụlọ ọrụ n'Enugwu nke ekweghị ka agbaa ya ajụjụ ọnụ n'ihe onyonyo gwara BBC Igbo ihe ha chọrọ ka gọọmentị mee. Nke mbụ bụ ka gọọmentị mee ka ọnọdụ ndị ọrụ ụgbọelu bụ NCAA n'ịchafụ na-adị mma na Naịjirịa. Ha chọkwara ka ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha gbalite n'ogo. Ọ gwara n'ihu kwuo na ha akwụsịghị mfepụ na mbata ụgbọelu n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-45308907,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45308907,Ihe a gbatara na Premier League: Arsenal enwetala mmeri mbụ ha n'okpuru Unai Emery,"Arsenal nwetara mmeri mbụ ha kemgbe Unai Emery bidoro ịchịkọta ha, ebe mmeri Liverpool meriri Brighton mere ka ha were pọintị abụọ na-aga ndị na-esote ha n'elu tebulu Premier League.","Mmeri Arsenal bịara ka Manchester City na Chelsea merichara ha n'egwuregwu ha ji bido afọ a E nyere Richarlison na-agba Everton bọolụ akwụkwọ ọbara ọbara ma chụpụ ya ka ha na Bournemouth gbara onye laba onye laba (2-2). A chụpụkwara Adam Smith bụ onye Bournemouth, nke pụtara na ha na Everton ezughị ezu wee gbachaa egwuregwu nke taa. Leicester City n'onwe ha meriri Southampton (2-1), ebe a chụpụrụ Pierre-Emile Hojbjerg na-agbara Southampton ka ọ natara akwụkwọ edo edo abụọ. Enweghị onye meriri ibe ya n'etiti Huddersfield na Cardiff, n'agbanyeghị na a chụpụrụ otu onye Huddersfield (0-0). Ndị Wolverhampton mere Manchester City bụ ndị buliri iko Premier League n'afọ gara aga ihe tụrụ ha n'anya taa ka ha na ha gbara onye laba onye laba (1-1). Akụkọ ga-amasị gị:" 47944819,https://www.bbc.com/igbo/47944819,"Rudeboy Reason with me: ""Ọ bụghị iwu na ị ga-alụ nwaanyị ọbụla mụtara gị nwa""",Paul Okoye kọwara ihe ọ hụrụ n'aka ụmụnwaanyị n'ime egwu ọhụrụ o tiri bụ 'Reason with me'.,"Ọ kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na ụmụ nwaanyị dị icheiche na-apụta agwa ya na ọ tụwara ha ime. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a. Dịka okwu a na-ewu na soshal midia, lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya ebe a: Olisa kwuru na ọ kọwara akụkọ ndụ mmadu n'ime egwu ahụ Starvy na-agwa asa ya nya biko nye ha ohere gee ya ntị Ebe Taiwo na-ekwu na ọ bụrụ na ya na ejima abịaghị na ọ gaghị ege egwu ya ntị" afirika-49855788,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49855788,Julius Agwu: Amataghị m nwunye m na ụmụ m ka m si 'coma' teta,"Onye e ji emume ịkpa ụkaọchị mara bụ Julius Agwu bịara na ""Gịnị n'afịọ"" bụ emụme nkiri puruiche nke BBC Igbo na-eme na Fraịde ụbọchị iri abụọ na asaa na Septemba nke afọ 2019.","Julius Agwu Julius kwuru ọtụtụ okwu gbasara ahụike ya bụ nke ọ ka na agbake na ya. Content is not available End of Facebook post, 1 Ọ sị n'afọ 2016, ka ọ fọrọ abalị abụọ ka ya gaa ihe ngosi ịkpa ụkaọchị o nwere na London ka uche ya furu. Ebe ya nweteziri onwe ya bụ n'ụlọọgwụ bụ ebe ya nọrọ izuụka abụọ tupu ya amata onwe ya. Mgbe ọ tetere na ya bụ ụra ọnwụ, ọ mataghịzị nwunye ya bụ onye nọ n'akụkụ akwa ọrịa ya. Ọ sị na awara ya akpụ n'isi tupu ya bụ ọrịa abịa. Julius ka na-agbake na ya bụ ọrịa dịka ọ maliterela ọrụ ejije ya. Ọ kelere ndị niile kpeere ya ekpere mere o ji gbakee. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnụdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana" afirika-52024159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52024159,Hand Sanitizer: Lee etu ị ga-esi rụpụta nke gi,Mmadụ idebe aka ya ọcha bụ ụzọ kacha dị ire iji gbanahụ ọrịa na-efe efe dịka coronavirus.,"Mmiri nkwọcha pụrụ iche Bekee kpọrọ 'hand sanitizer' dị nnọọ nnukwu mkpa ugbua. 'Hand sanitizer' na-adazi oke ọnụ n'ahịa ugbua. Mana egwu atụla gị, lee etu i nwere ike isi rụpụta nke gi na-emefughi nnukwu ego. Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 53743738,https://www.bbc.com/igbo/53743738,Ihe dị iche na kalenda ndị Igbo na nke Bekee,E nwere ụbọchị ahịa anọ n'ala Igbo.,"Foto na-egosi aha ụbọchị ahịa n'ala Igbo... Eke, Orie Afọ & Nkwọ. Ha bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Ahịa ndị a ka ndi Igbo na-eji agu afọ nke a na-akpọ 'Igbo calendar' na Bekee. Foto na-egosi aha ụbọchị ahịa n'ala Igbo... Eke, Orie Afọ & Nkwọ. Ọtụtụ obodo nwere ụzọ ha na-esi agụ ụbọchị, izuụka, ọnwa na afọ nke ha, mana nke ndị mmadụ kacha mara bụ nke ndị Bekee kpọrọ 'gregorian calendar'. Kedụ ka kalenda ndị Igbo sị dị iche na nke ndị Bekee? Kalendar nke ndị Bekee. Iji afọ 2020 maa atụ Afọ 2020 nke Bekee nwere ọnwa iri na abụọ (12). Nke Igbo nwere iri na atọ (13). A bịa n'ụbọchị ole dị n'otu ọnwa, nke ndị Bekee dị iri atọ (30) ebe nke ndị Igbo dị iri abụọ na asatọ (28). Ihe ndị Igbo na-akpọ ọnwa niile dị afọ nakwa ihe ndị Bekee na-akpọ ha Ka anyị nwale kalenda nke Gregorian na ọnwa ya na nke Igbo dịka Odumegwu Obudigwe bụ onye ọkachamara n'omenala bụkwara onye nchịkọta omenala na njem elete n'Aguleri, Anambra steeti. January/ February- Ọnwa ntufu March - Ọnwa etufucha agunye nge April- Ọnwa nge May- Ọnwa abụọ June- Ọnwa atọ July- Ọnwa anọ August- Ọnwa ise September - Ọnwa isii October - Ọnwa asaa November - Ọnwa asatọ December - Ọnwa ụma mara afọ - Ọnwa ntufu (ọnwa nke ịkpaazụ) Ụbọchị izuụka Bekee na nke Igbo Dịka ndị Bekee na-eme ọnụ ọgụgụ izuụka ha site n'ụbọchị ụka (Sunday) rue n'ụbọchị ezumike (Saturday), ndị Igbo na-eji ụbọchị ahịa eme ọnụ ọgụgụ nke ha. Ha na-ebido n'ahịa Eke rue na Nkwọ. E nwere ụbọchị anọ (4) n'otu izu mana nke Bekee nwere ụbọchị asaa (7). Izuụka ole ka ndị Igbo nwere? Dkt Nnabuihe nke Mahadum Legọs kọwara na izuụka asaa bụ otu ọnwa n'ọgụgọ afọ Igbo mana izu anọ bụ otu ọnwa na nke ndị Bekee. Ọmụmatụ ọnwa Ọgọst 2020 na izuụka ole o nwere Etu kalendar Igbo na nke Gregorịan siri yie onwe ha. Akụkọ ga-amasị gị" 43085667,https://www.bbc.com/igbo/43085667,Buhari: Minista na ahụ maka nchekwa gawa Zamfara.,"Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ezigala minista na-ahụ maka nchekwa akpọrọ Mansur Dan-Ali na Zamfara steeti, ka ọ ga-nyochaa etu ihe si kwụrụ n'obodo Birane dị n'okpuru ọchịchị steeti ahụ ebe e gburu mmadụ iri atọ na ise ụnyahụ.","Buhari akatọọla oke ogbugbu narala mmadu iri atọ na ise ndụ na Zamfara Onye na-ekwuchitere onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuputere ihe a n'akwụkwọ ozi o wepụtaara ndị ntaakụkọ. Shehu kwuru na minista ahụ kwesịrị inyocha ọnọdụ a ma wetakwara Buhari ozi ozugbo, ebe o kwuru na ọ katọrọ ya bụ oke ogbugbu. O kwukwara na Buhari enyela iwu ka ndị nche ala Naijirịa ziga ndị ọrụ ha ebe ihe mberede a mere ma nwụchie ndị omekome kpara arụ a. Shehu kwusirike na Buhari na-agba mbọ n'ihụ na oke ogbugbu a na-eme n'akụkụ dị icheiche na Naijirịa kwusịrị. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru, ""Onyeisiala nwere nnukwu mwute ebe ezinaụlọ ndị egburu n' oke ogbugbu a nke merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. Ọ na-ayọ Chukwu ka ọ kasie ndị nọ n'iru uju obi.""" afirika-43687798,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43687798,Nzeribe: Mmegbu butere akwa nwereonwe Ndị Igbo,"Onye bụbu onye na-anọchiteanya Ihiala Federalụ Konstituensi n'ụlọomeiwu nke nta bụ Chuma Nzeribe, kwuru na mmegbu a na megbu ndị igbo gbanyere ụkwụ na iwu ala Naijiria ebe e nyere mpaghara ọdịda anyanwu ugwu Naijiria steeti asaa, ndị ọwụwa anyanwụ nwere nanị ise.","Chuma Nzeribe nọchiteanya Ihiala Federalụ Konstituensi n' ụlọomeiwu nke nta ugboro abụọ O kwuru na enwekwughị steeti abụọ bụ ọghọm ego ọwụwa anyanwụ kwesiri ịna-enweta site n'akpa gọọmenti etiti. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ akụkọ Vanguard nwere, Nzeribe si: ""Akwa nwereonwe na-ada n'ala Igbo gbanyere mgbọrọgwụ na mmegbu. A kpachara anya na-akpagbu ndị ọwụwa anyanwụ n'ihe gbasara uru dị n'ọchịchị, mmepe na nnọchiteanya in ọkwa dịga mkpa n'ala anyị. ""Mkpagbu a gbanyere ụkwụ n'iwu ala anyị, ebe e nyere mpaghara ụfọdụ dịka mpaghara ọdịda anyanwu ugwu, steeti asaa, ndị ọwụwa anyanwụ nwere nanị ise. ""Enwekwughị steeti abụọ bụ ọghọm ego ọwụwa anyanwụ kwesiri ịna-enweta site n'akpa gọọmenti etiti. Lele ihe steeti ọbụla na-enweta kwa ọnwa. ""Uche m bụ na a na-agọnarị anyị okpuru ọchịchị iri asatọ(80 LGAs) nke bụ ihe karịị ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị nwekwuru steeti abụọ. ""Ị lee anya n'ego na-abịara steeti na okpuru ọchịchị, na egọ sị n'akpaego gọọmemntị etiti, ị hụ nnukwu ọghọ ndị ọwụwa-anyanwụ na-agabiga."" Ọ gara n'ihu rụọ aka na dịka ndị mpaghara ndị nwere steeti asaa nwere Sinetọ atọ,atọ, nke mere ka ugwu-awụsa sinetọ iri abụọ na otu, ọwụwa-anyanwụ nwere nanị iri na ise. O kwukwara na iwu ala Najiria mere ka steeti ọbụla nwe otu mịnịsta nke mere na ebe mpaghara ugwu-ọdịda anyanwụ nwere mịnịsta asaa, ọwụwa-anyanwụ nwere nanị ise. O kwuru na okwesiri ka e si na-imegharị iwu lebe anya na nsogbu ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43638054,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43638054,Nwanyị bu egbe emerụọla mmadụ ato ahụ n'isiụlọọrụ YouTube,Ndị uweoji na mpaghara ugwu California ekwuola n'otu nwaanyị bu egbe emerụọla mmadụ atọ ahụ n'isiụlọọrụ na-emepụta ihe onoyonyo a kpọrọ Youtube tupu o gbuo onwe ya.,"Youtube bụ ụlọọrụ nọ n'ọkpuru Google Ndị ntaakụkọ na mba Amerika enye la aha nwanyị a ka Nasim Aghadam ma kwukwa na ọ bụ esemoku ezịnaụlọ kpatara mwakpo a E chere na otu nwoke so na ndị merụrụ ahụ ụnyahụ bụ enyi ya nwoke ụlọọrụ, CBS na-ekwu. Umu nwaanyị abụọ dị afọ 32 na ọzọ dị 27 merụrụ ahụ na mwakpo a. N'agbanyehi nke a ndị ntaakụko na-ekwu, ndị uweoji ekwụpụtabeghị ihe nwaanyị ji buru egbe wakpo ndị mmadụ na Youtube. Ndị ọrụ na Youtube kọwara ihe na-eme n'elu igwe okwu: Aghadam bụbu onye na-emepụta ihe onyonyo na Youtube katọrọ Youtube n'oge gara aga maka ọ sị na ha na-akpachị ihe onyonyo ya. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-50698915,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50698915,Anthony Joshua vs Andy Ruiz: Etu Anthony Joshua si 'kwadoro' Ruiz Jr,"Nwaafọ Naịjirịa bụ Anthony Joshua ga-ezute Andy Ruiz Jr na Saụdị Arebiya n'abalị Satọde a maka asọmpị nke abụọ ha nke ha ji azọ ihe nrite Bekee kpọrọ ""World Heavy Weight Boxing Championship"".","Nnukwute ọgụ na-eche mmadu abụọ na ọkpọ mpịagharịa ha ga-akpịa n'ama egwuruegwu Diriyah bụ ebe ga-abata mmadụ 15,000. Ọ bụ n'elekere asatọ nke ehihe (8:30 PM) n'oge Naịjirịaa ka a ga-amalite isu ha bu ọkpọ. End of Twitter post, 1 Ọ bụ n'ọnwa Juun nke afọ 2019 ka Ruiz Jr narala Joshua ihe nrite niile oji aka mgbe ha zutere na obdodo New Yọk. I'm here to win - Anthony Joshua and Andy Ruiz Jr face the media before their rematch Joshua sị: ""A no m ebe a imeri, egwu adịghị atụ m..., ekperem ekpere ma wepụta ohere ji nabata ihe ga-eme n'Satọde"" Ndị ọkụ ọkpọ abụọ a siri ime mgbe ha zutere n'ụbọchị Wenesde bu oge enyochara etu ha ra." media-45637256,https://www.bbc.com/igbo/media-45637256,Ụlọikpe ukwu sị na iwu akwadoghị mwepụ Madumere,Eze Madumere enwerela mmeri n'ụlọikpe,"Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo Steeti Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe ukwu akagbuola nchụpụ ahụ a na-achọ ịchụpụ osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere. Ọkaikpe Benjamin Iheaka kwuru na ya bụ usoro achọrọ iji chụpụ Madumere adịghị n'akwụkwọ iwu ala Naịjirịa. Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017 Otu pati APC adọọla Uche Secondus nke PDP aka na ntị maka ajọ okwu ha sịrị na ọ gwara ha. N'akwụkwọ nke onye osote odeakwụkwọ mgbasa ozi APC tinyere aka, ha sị na ọ bụ ịkpụ ugwu ya n'ala site n'ibo ebubo na APC na Inec gbara ha mgba okpuru na ntụlịaka e mere n'Osun steeti n'izuụka gara aga. Donald Trump onyeisi óchíchí mba US Na elenu o, ka ọgbakọ mbaụwa UN na-aga n'ihu ugbua ebe a na-atụ alo maka udo na nchekwa tọrọ atọ n'ụwa, Donald Trump nke Amerika emeela ka ngwere dara elu. Donald Trump kpapụrụ ndị isi ibe ya ọchị ka ọ sị na gọọmentị ya arụọla ọrụ ndị ọzọ arụnwụghị n'afọ abụọ ọ chigoro. Mourhino zuru Lampard na Chelsea N'egwuruegwu, nna na nwa ga-akwakọta mpi mgbe otu Derby County ga-ezute `Manchester United n'elekere asatọ nke abalịa. Cheta na Frank Lampard bụ onye nkuzi ndị Derby ugbua mụrụ ọrụ n'aka Jose Mourinho oge ha nọ na Chelsea. Ngeria Air Minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na asiri ndị mmadụ na-agba na ọ bụ enweghị ndị nkwado mere ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ jiri pịachie nkụ bụ ụgha. Sirika sị ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ nwere ọtụtụ ndị ụkwụ siri ike n'ala bụ ndị nwere mmasị ịsonye na ụlọọrụ Air Nigeria. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Luka Modric enweela mmeri Luka Modric bụ onye FIFA turu ugo dika onye kachasị agba bọọlụ na ụmụnwoke n'afọ a. Marta Vieira da Silver bụ onye turu ugo nke ndị ụmụnwaanyị. Mohammed Salah bụ onye turu ugo dịka onye nyere goolu nke kachasị tụụ ụtọ. Ndị ntọ atọhapụọla ndị njem so God is Good? Ha tọrọ ndị a n'ime izuụka abụọ garaaga. Mana ndị ntaakụkọ Premium Times dere na ụfọdụ ezinụlọ kwuru ego ntọhapụ tụpụ ha atọhapụ ndị be ha. Ndị uweojii gwara BBC Igbo na ha ka na-eme nchọpụta maka ihe mere, ma kwụkwa na ọ bụ eziokwu na-onwere ndị a tọọrọ. Gịnị na-eme n'Osogbo? Egwu dịkwa n'ọfọdụ ebe n'Osogbo isi obodo Osun steeti o. Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụda egbe dara na mpaghara Alekuwodo n'ime steeti ahụ ụnyaahụ. Cheta na Alekuwodo bụ otu n'ime obodo a ga-eme ntụlịaka ọzọ ga-ahọpụta gọvanọ nke steeti ahụ. Akụkọ kwuru na mgbọ meruru nwa nwaanyị dị afọ iri na abụọ na ụmụnwoke abụọ ahụ na ọgbaghara ahụ. N'ofesi Ndị so n'ime nkwekọrịta nụklịa nke mba Iran ekwuola na ha ga-achọpụta ụzọ ọhụrụ ha na mba Iran ga na-azụ ahịa agbanyeghị na Amerịka esepuola aka na ya bụ nkwekọrịta. Mana ọtụtụ ndị amamihe gbasara okwu a na-ekwu na ọ ga-afịa ahụ makana ego Iran adaala kamgbe Amerịka sepuru aka na yabụ nkwekọrịta. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke ụtụtụ a Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." egwuregwu-55093122,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-55093122,Zeke Nnaji: Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball',Zeke Tobechukwu Nnaji bụ otu n'ime ndị ntorobịa a kpọpụtara aha ha dịka ndị ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nkata na mba Amerịka.,"Ụmụ Naịjirịa asatọ so na ndị a kpọpụtara aha ha dịka ndị ga-esonye n'otu dị icheiche na ""National Basketball Association"". Tobechukwu kọọrọ BBC Igbo etu o si malite ịkụ bọọlụ nkata oge ọ dị obere. Nna Tobechukwu, bụ Afam Nnaji, gwara anyị na ya onwe ya gbakwara bọọlụ oge ọ na-eto eto, mana o jighi ya gaa n'ihu. Ugbua, Nnaji bụzi onye nkuzi nwa ya nwoke bụ Tobechukwu. Ha kwuru na ha na-atụ anya ịzụlite ọtụtụ ndị na-eme egwuregwu na Naịjirịa." afirika-44680176,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44680176,Ihe mere tanka anyi ga na-agba ụzọ Lagos - NUPENG,Onyeisi ngalaba na-achịkọta ndị ọrụ mmanụ ụgbọala nke Legos steeti akpọrọ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers na Bekee bụ Tayo Abeyeji kwuru na ndị na-anya ụgbọala buru mmanụ ụgbọala agaghị akwụsị ịgba n'okporo ụzọ Legos makana onweghị ụzọ ọzọ ha ga-agba.,"Mmadụ itoolu nwụrụ na ihe mberede a BBC Igbo gbara Abeyeji ajụjụ a maka akụkọ kwukwara na gọọmentị Legos ekewapụtala ụzọ ọhụrụ ga-abụ nke ndị ụgbọala buru mmanụ ga na-agba. Abeyeji gwara onye ntaakụkọ anyị na ya maghị ihe ọbụla gbasara okporo ụzọ nke a. N'ọnụ okwu Abeyeji, ""Onyeọbụla na-ekwu maka okporo ụzọ ọhụrụ nke ha kewaputara, mana gọọmentị ekwughị ihe ọbụla cha cha maka ọkpụrụ ụzọ ọhụrụ a. Anyị ga na-agba okporo ụzọ anyị na-agba ugbua"" Abeyeji na-ebo ajọ okporo ụzọ maka ihe mberede na-eme ụgbọala buru mmanụ Cheta n'ime izuuka garaaga, otu ụgbọala bu mmanụ ụgbọala gbawara n'akwa mmiri Otedola n'ime Legos steeti nakwa gbuo mmadụ itoolu. Abeyeji kwusiri ike na ọbụghị eziokwu na ndị na-anya ụgbọala buru mmanụ bụ ndị na-achọ ọnwụ. O kwuru na, ""Onye bụ onye isi ya dị mma ga-achọ igbu onwe ya? Ihe mere na Otedola ajọgbuola onwe ya mana ọbụghị makana onye yara ụgbọala ahụ chọrọ igbu ndị mmadụ"" Ihe mmụta n'ọkụ mmanụ gbara na Legos Abeyeji kwuru na ha na-agba mbọ ihụ na ụdị ihe a mere na Legos emeghị ọzọ. O kwuru na, ""Ugbua anyị na-achọ ị zụ ngwaọrụ ga na-enyocha ụgbọala anyị niile bu mmanu tupu ha agawa njem ọbula."" O kwukwara na oge ọbụla ka ndị otu ha na otu ''Federal Roads Safety Corps'' na-enye ndị na-anya ụgbọala bu mmanụ ọzụzụ di iche iche gbasara ụgbọala ha. ""Anyi na gọmenti anaghị ama aka mgba maka ihe a, ihe ọbụla ha chọrọ ka-anyị mee, anyị ga-eme"", Abeyeji kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45352886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45352886,Gọvanọ Ugwuanyi: Ego ọnwa ndị nọ ezumike nka agbagoola n'Enugwu steeti,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Buhari ekwela Theresa May nkwa Theresa May na Buhari zuteburu na UK n'ọnwa Epreelụ nke afọ a Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ ga-akwado ntuliaka ziri ezi n'afọ 2019, O kwere nkwa a ka ya na Theresa May bụ praịm minista ndị Briten zụkọrọ n'Abuja ụnyaahụ. Cheta na May bịara Naịjirịa ka ya na Buhari kpaa maka azụmahịa, nchekwa nakwa ịgba mgbere mmadụ. Ugwuanyi Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ekwuola sị na ụgwọ a na-akwụ ndị lara ezumike nka arigoola ihe karịrị nde narị naịra ise site na nde narị naịra abụọ ọ bụbu. O kwuru sị n'agbanyeghị na ego ahụ dịka ibu anyị danda nye gọọmentị, na obi dị ha mma na ịkwụ ya na-eme ka ndụ dịrị ndị agadị mfe. Na mba ofesi, Mba Jamini ebughachitela okpokoro isi ndị mba Namibia nwụrụ na mgbukpọ nke agbụrụ ihe karịrị afọ narị gara aga. Ndị si Namibia bịara kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu E zigara ọkpụkpụ ndị ahụ Jamini maka nchọpụta ahụ akatọrọla nke bụ iji gosi na ndị ọcha ka ndị isi ojii mma. N'egwuregwu, A pịapụla Andy Murray n'agba nke abụọ nke asọmpi tenis bụ US Open. Fernando Verdasco meriri ya n'ihe bụ asọmpi Grand slam nke ise ọ na-esonye kemgbe a wachara ya ahụ maka ahụ o merụrụ n'ukwu na Jenụwarị. Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụfọdụ ndị Igbo ekwuputela ihe ha ga-achọ ka Praịm Mịnịsta Briten mere ha ka ya na onyeisiala Muhammadu Buhari zukọrọ. ""Ihe anyị chọrọ ka Theresa May mere anyị""" afirika-43100193,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43100193,BBC Igbo ebidola ọrụ ha na Naịjirịa,Ihe a ọ bụkwa BBC a ma ama?,"O mere anyị dịka nrọ mgbe ndị BBC gwara anyị na ha ga-ebido mgbasa ozi ha n'asụsụ Igbo Mgbe ọtụtụ n'ime anyị hụrụ mgbasaozi ọrụ BBC, anyị ekwenyeghị. Ụfọdụ sị, ""Taa, Ụgha!"" ""Ezigbo aghụghọ."" Ụfọdụ asịkwa, ""Ewo!"" ""Ọ bụkwa BBC n'ezie?"" Anyị cheburu echichie, wee si ka anyị ""gbakwa mbọ ka e lee ihe ọ ga-apụta"". Mgbe o dooro anyị anya na ọ bụ eziokwu, ọtụtụ echeghị na ha ga-akpọkwa anyị. BBC kwa? Ụlọọrụ nke ụwa niile ma ama na mgbasaa akụkọ ziri ezi? Ha agaghị anabata ndị dịka anyị n'ọrụ. Nkwa kwụrụ ọtọ Dịka BBC anaghị alaghachị azụ na nkwa ha ịnabata ndị si ebe ọbụla, ọ bụkwa etu BBC Igbo dị. Lekwa ndị mgbasa ozi BBC Igbo Anyị sị ọtụtụ ebe, dị icheiche. Okwu a bụkwa ihe na-edukwa anyị. Ụlọọrụ BBC Igbo so n'otu ime ụlọọrụ asụsụ isii a malitere n'Afrịka makwa bụrụ otu n'ime ụlọọrụ asụsụ iri na abụọ ọhụrụ so na BBC World 2020 nke ọchịcụhị ndị Britain jiri nde narị iri na iteghete kwalite. Igbo e ji eme ọnụ Asụsụ Igbo bụ asụsụ mara mma n'ọnụ bụkwa asụsụ ụda, gwamgwamgwam, nke ilulu na-eso okwu juru n'ime ya! ""Igbo si na ilulu bụ mmanụ Igbo ji eri okwu"". Igbo bụ asụsụ agba puruiche. Anyị na-atụ anya n'iji hụ na anyị gosiputara ma kwalite agba di icheiche mere ka Igbo bụrụ asụsụ mara ezigbo mma, ma nọkwa n'ọkwa ya dịka otu n'ime isi asụsụ iri na otu dị na Naịjirịa. Anyị bụ otu ndị gbasiri ike, n'omume ma n'akọ na uche. Ndị na-agba ntaakụkọ n'ụzọ ziri ezi dịka ọ di na BBC kwa ụwa niile n'iji kọọrọ akụkọ ndị Igbo, n'olu Igbo makwa mekọta omenala Igbo na omenala mgbasa ozi site n'igwe mgbasa ozi ọhụrụ. BBC n'anya anyị n'oge izizi Mgbe anyị bịara ọhụrụ na BBC, ihe anyị buru ụzọ ghọta bụ na BBC nọ n'ụwa nke onwe ya, atụmatụ ebe igwe di ichiiche n'ụzọ ọrụ ndị ntaakụkọ puruiche. Ị ga-ejinwu asụsụ Igbo gụọ abụ ala Naịjirịa? N'ụlọọrụ nke Legọs, ebe ndị si mpaghara Naijirịa na-arụkọta ọrụ dịka etu anyị siri bikọta ọnụ dịka ndi agbataobi n'obodo Naịjiria. Ebe a ka BBC Pidgin, BBC Igbo na BBC Yoruba na-arụkọta ọrụ. Anyị dịka ndị si n'otu ezinụlọ BBC dịka nnekwu na-elekọta ụmụ ya. Ha nyere anyị nnukwu nnabata mgbe anyị bidoro ọrụ ebe a. N'agbanyeghị na anyị na-asụ asụsụ dị icheiche, anyị bụ otu. Na BBC, anyị na-arụkọta ọrụ dịka otu. Ndị Yoruba na Pigdin sokwa n'asụsụ atọ a malitere nke ga-efenye ndị nkiri anyị na Naịjirịa na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka nke ga na-arụ site n'otu ụlọọrụ. Anya na-achọpụta ihe zoro ezo maka iwepụta akụkọ kacha mma Adimiche ndị otu kwesịrị ịbụ nsogbu bụ ngozi, dịka anyị ji ezigbo ọrụ, nkwanyere ugwu, ihunanya na nkwenye mee ngwa ọrụ anyị. Ezigbo akọ ziriezi Dịka nkwado kwesiri ekwesi, BBC jiri aka ha zụọ anyị n'ụzọ ndị ntaaakụkọ ha. Nke a ka anyị ga-eji ekele ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ bụ oge ọmụmụ etu anyị ga-esi gbasaa akụkọ n'asụsụ anyị. Ndị nkuzi si BBC London bịara were aka anyị ma zikwa anyị ụzọ anyị kwesiri ji rụọ ọrụ. Ha gbara mbọ hụ na onye ọbụla ghọtara ihe a na-akuzi. Nke a bụ mbụ Nke a ga-abụ nke mbụ anyị ga-anụ akụkọ Igbo kwụrụ ọtọ nke ya na-agbakwasaghị n'ụgha ga-amasị ndị ntoroọbịa na ụmụnwaanyị. Dịka asụsụ ndị ọzọ so anyị bụ Yoruba na Pidgin, anyị enwela ohere ịkọwapụta akụkọ anyị ka o siri dị, ebe ndị na-ekiri maọbụ na-ege anyị bụ isi-ahụrụ-kwawa-okpu n'ihe ọbụla anyị na-eme." 49099191,https://www.bbc.com/igbo/49099191,Fuel scarcity: Ọdụ mmanụ ụgbọala niile dị n'Enugwu gbachiri agbachi,Ndị mmadụ bi n'Enugwu na-ata ikikirieze tata bụ Wenezde dịka otu jikọrọ ndị na-ere ma na-ekesa mmanụ ụgbọala gbachiri ọdụ ahịa ị iche iche n'ihi na e nwere nsogbu n'etiti ha.,Ndị otu PEDAN na IPMAN ka a na-arụ aka na ọ bụ ha gwara ndị oti ha ka ha gbachisia ụlọ mmanụ ha. Ya bụ mgbachi bịara ndị Enugwu na mberede nke bụ na ndị njem na ndị nwere ụgbọala nọ na nsogbu ugbua. BBC gagharịrị Enugwu niile wee hụ na o nweghị nke mepereụbọchị Wenezde. Naani ọdụmmanụ nke gọọmenti nwe bụ NNPC bụ ihe na-ere mmanụ ụgbọala. Nari kwụrụ narị ụgbọala kwụzị na ahịrị na ahịrị na NNPC mega dị n'Enugwu eche mmanụ. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-43276401,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43276401,Charly Boy ekwuola na ọ chọrọ ndị ntoroọbịa pụrụiche maka ịchị Naịjiria,Onye ama ama dịka Eze ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Charly Boy kwuru na obi adịghị ya mma maka ọnọdụ Naịjirịa.,"Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, ọ jụrụ ""Gịnị mere o jiri bụrụ ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa?"". Charly Boy kwuru na ọ na-achọ ndị ntoroọbịa pụrụiche ọ ga-akwado maka ị were oche ọchịchị Naịjirịa. ""Ọbi na-agwa m kamgbe afọ iri atọ na ise gara aga na nzọpụta Naịjirịa ga-abụ maka ndị ntoroọbịa pụrụiche,"" dịka Charly Boy kwuru. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43182254,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43182254,Owere: A nwụchiela onye ohi ụlọakụ,"Oge a kpụpụtara Chinonso Onwuegbuchulam bụ onye Obazu Mbieri dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli n' Imo steeti ka ọha hụ ya, onyeisi ndị uweojii Imo steeti bụ Chris Ezike kwuru n'ejidere ya ebe o zoro na Port Harcourt, Rivers steeti.","Onye a tụrụ ịga Ezike kwuru na diọkpa ahụ kwetara na o so kpaa mkpamkpa ahụ nke o nwetara puku naira 400, n'ime nde naira 2.8 ha zutere n'ụlọakụ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onwuegbuchulam kọwakwara na ya banyere n'ọrụ iji egbe aga ohi kamgbe afọ 2012, ma sonyekwara n'ọtụtụ iji egbe zuo ohi nke mere n'Owere, Lagos na Port-Harcourt, bido oge ahụ were ruo afọ 2017. Cheta na n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Februwarị afọ gara aga, n'oge elekere atọ nke ehihie, ndị ojiegbeezuohi dị mmadụ anọ so otu onye gara ụlọakụ dị na Wetheral Road, Owere, banye ọgba ụlọọbaego ahụ. Ha gbara egbe iji chụpụchaa ndị mmadụ na ndị uwe ojii atọ nọ ọrụ na ụlọakụ ahụ, ma zuru ego. E mechara nwụchie mmadụ atọ ma gbagbuo ha, ebe otu gbara ọsọ." 44608284,https://www.bbc.com/igbo/44608284,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụlọikpe enyela ndị otu Nnamdi Kanu 'bail',Akụkọ ndị dị mkpa n 'abalị a,"Ndị otu Nnamdi Kanu enwetala 'bail' Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a hapụ ndị otu Nnamdi Kanu nọ na nga kamgbe afọ atọ n'ọnọdụ bekee kpọrọ 'bail'. Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ọ na-ahapụ ha na bail maka ọnọdụ ahụike ha nakwa afọ ole ha nọrọla na nga. O kwuru na ọ bụrụ na ikpe maa ha, na ha kwesịrị inweta ihe ruru afọ ise maọbụ asaa, mana ha anọrọla afọ atọ. Cheta na Ọkaikpe Nyako nyere iwu ka a ghara ikpekọta ikpe Kanu na ndị otu ya n'ụbọchị Febụwarị 20, 2018, maka na amaghị ebe Kanu nọ gbochiri ọganihu ikpe ha. Mmadụ anọ a hapụrụ bụ Bright Chimezie, Chidiebere Onwudiwe, Benjamin Madubugwu na David Nwawuisi, bụcha ndị otu Ipob. Nyako kwuru na otu n'ime ha bụ Chimezie nwetaburu 'bail' n'ọnwa Mee nke 2017, mana ndị DSS ji ya oge ahụ jụ ịtọghapụ ya. Ọnọdụ 'bail' o nyere ha bụ ka ha kpọta mmadụ abụọ bụ ndị akaebe ga-enwe nde naịra 10, nakwa ka ha ghara ịgwa ndị ntaakụkọ okwu maọbụ sonye na nzukọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha ga na-agakwukwa ndị kọmishọna ndị uweojii nọ na steeti ebe ha bi, kwa izu abụọ. Gịnị ga-eme Abaribe echi? Omeiwu Enyinnaya Abaribe a ga-anọ n'ọchị ka ọ bụ akwa echi? Echi bụ ụbọchị ndị ụlọikpe kwuru sị ya kpọpụta Nnamdi Kanu ma ọ bụ ọ takwute ya aja. Cheta na ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018 ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe, kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ. N'akụkọ mba ofesi Ndị ọrụ nchekwa si mba Amerịka bụ FBI erutela Itiopịa ebe ha ga-enye aka ime nyocha ogbunigwe gbapụrụ ma merụọ ndị mmadụ ahụ ụbọchị ole gara aga. N'otu aka ahụ, otu onye na-echekwa onyeisiala ndị Zimbabwe anwụọla site n'ahụ ọ merụrụ ka ogbunigwe gbara ebe onyeisiala Emmerson Mnangagwa na-ekwu okwu ụbọchị abụọ gara aga. N'egwuregwu, Ureguwa ji ọkpụ goolu atọ merie ndị na-ele ọbịa asọmpi Iko Mbaụwa bụ Rọshịa. Ebe ndị Sawudi Arebia ji ọkpụ goolu abụọ merie Ijipt, nke bụ na Ijipt apụọla n'asọmpi a. Gee nkeji nke abalị a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Otu nwoke a kpọrọ Festus Ijeomah na nwanne ya nwoke gara n'ụlọọrụ ndị FRSC nke e ji 'Road Safety' mara, ebe ha gosipụtara iwe ha maka ụgbọala ya ndị FRSC kpọkasịrị kemgbe afọ 2017. Otu nwoke kọwara etu ndị FRSC si daa iwu ha hibere" afirika-45199774,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45199774,Otu CAN chọrọ ka ndị Nigeria Kpee ekpere ma buo ọnụ ụbọchị atọ,Samson Ayokunle bụ onyeisi ndị 'Christian Association of Nigeria (CAN)' kwuru na ọ dị mkpa ka ndị ụka Kraịst na gburugburu Naịjirịa buo ọnụ ma mee ekpere maka ọgwụgwọ nsọ Naịjirịa.,"Cheta na CAN rịọkwara ndị mmadụ ka ha kpeere Naịjirịa ekpere n'ọnwa Julaị Ayokunle kwuru na a ga-eme ekpere a site n'Ọgọst 27 ruo 29, ma kwuo na ekpere na ibu ọnụ a bụkwa maka mkpuchikọta Naịjirịa nakwa ọchịchị onyekwuoucheya nke obodo a, ọkachasị ntuliaka 2019 na-abịa. Nke a dị n'akwụkwọ ozi Ayokunle zipuru site n'aka onye enyemaka ya pụrụiche bụ Adebayo Oladeji, taa n'Abuja. Iji kọwaa ihe mere ekpere a ji dị mkpa, Ayokunle kwuru na tigbuo zọgbuo dị n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụzị ihe ihere nye ọchịchị onyekwuoucheya. O kwukwara sị ndị isi ụlọụka niile dị na mpaghara Naịjirịa gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ mere ekpere a. N'aka ọzọ, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta Leah Sharibu nakwa ụmụakwụkwọ Chibok nọ n'aka Boko Haram. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-49203872,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49203872,Nigerian Actors: Ihe mere ndị ome nkiri Nollywood ji arịọ ego ma ọrịa bịa,"Onye na-eme ejije na Nollywood bụ Emeka Amakaeze, kọwara etu ụdịri emume mmadụ na-eme n'ejije nwere ike ịmetụta etu e ji ahụ onye ahụ.","Ọ sị na ụfọdụ mgbe, a na-ahụ mmadu n'ụdị na-abụghị eziokwu. Amakaeze sị na o bụ ihe a na-eme o jiri na-ara ndị mmadụ ahụ ikwenye na ndị na-eme ejije ejighi ego ha ji eme mgbe ha chọrọ enyemaka. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo Akụkọ ndi ọzọ ga-amasị gị:" afirika-56987521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56987521,Crayfish Business: Njem 'crayfish na-aga site n'osimiri ruo n'ọdọahịa,Ịsha bụ crayfish bụ otu n'ime akụrụngwa ndị dị mkpa e ji esi nri ka ọ dị ụtọ.,"Ndị na-akụ azụ na mba mmiri kọwara etu ha si akụta ya site n'osimiri ma ghee ya maka iji e si nri. Usoro ndị ịsha na-agabiga gụnyere; ịkụta ya na mmiri, ịgbasa ya, ịhụkpọ, ịgba ya n'akpa ma buru ya gaa ahịa. Kirie usoro ndị a n'uju; Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke na Adline Okere Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55818208,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55818208,"Orlu Crisis: ""Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu""",Orlu bụ obodo dị n'Imo steeti bụ ebe enwebughi nsogbu chaa chaa.,Mana ndị bi ebe ahụ na-atụzị egwu ndụ ha dịka ọgbaghara dapụtara n'etiti nfdị agha na otu ọzọ amabeghị ndị ha bụ. Nke a butekwara ọnwụ ụfọdụ mmadụ mgbọ tụrụ gbuo. Lee ihe BBC Igbo chọpụtara mgbe anyị gara n'ebe ahụ. afirika-50901037,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50901037,Sowore: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya,Dịka ọ dị ugbua Sowore enwerela onwe ya dịka ndị ntaakụkọ Sahara Reporters gosiri n'akara twitter ha.,"Omoyele Sowore Kemgbe ahụ ọtụ mmadụ ekwuola ọtụtụ ihe gbasara ntọhapụ atọhapụrụ ya. Onye Ọkaiwu bụ Malachy Ugwummadụ sị na ịtọhapụ Sowore ugbua bụ ịmechepụ ihu ihere gọọmenti bụ nke ha mechuru onwe ha site n'ijichi ya kemgbe ụlọikpe sị ka ahapụ ya. Nwaamadị Brown Godwin kwuru n'akara Twitter ya na ọ dịka onyeisiala na-agbara ndị mmadụ Ekeresimesi site n'ịtọhapụ Dasuki na Sowore. End of Twitter post, 1 Femi Fani Kayode na onwe ya sị ""ihere megbu ndị niile kwadoro ka ejichie Sowore na Dasuki"" Nwafọ Igbo ama ama na Twitter bụ Joe Aba sị na obi dị ya ụtọ ka esi tohapụ Sowore na Dasuki ugbua, mana na ọ bụrụ na atọhapụrụ ha mgbe ekwesiri, na ọtụtụ ihe meberi agaghị emebi. Ndị otu SERAP na ọnwe ha sị na ha nabatara ntọhapụ atọhapụru Sowore na Dasuki mana ha ji ohere a arịọ gọọmenti ka ha kagbuo ebubo niile eboro ya ma tọhapụkwa ndị ọzọ dịka Agba Jalingo ozugbo ozugbo ma malite ịkwanyere ikike dịịrị onye ugwu na Naịjirịa. Ọ sị na gọọmentị Buhari ekpebie irube isi n'iwu ụlọikpe nyere sị ka atọhapụ Dasuki na Sowore. Malami sị na mkpebi ka a tọhapụ ha bụ n'usoro na ha ga-erube isi n'iwu na-eche ntọhapụ ha dịka ụlọikpe kwuru. N'okwu ya Malami sị ""mmadụ abụọ ndị a ga-erube isi n'ọnọdụ ụlọikpe nyere iji tọhapụ ha ma ghara ime ihe ọbụla ga-ebute ọgbaghaara n'obodo."" Mana Malami sịrị na ọ ga-agba akwụkwọ n'ụlọikpe megide iwu sị ka a tọhapụ ha kama na ha gaa n'ihu kporie ndụ nwereonwe ha ugbua. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Olando Ikoku ekwuola na ha nwetera mkpesa sị na otu Pastor metọrọ otu nwatakiri gbara afọ iri na nwanne ya nwannyi gbara afọ iri na isii. Pastọ ahụ aha ya bụ Kennedth Onyeali bụ onyeisi nchụaja ndị Christ New Covenant Church dị n'okpuruọchịchị Ohaji Egbema dị n'Imo steeti. Onyeali metọrọ nwa ahụ ka ọ na-ekpere ya ekpere ka ahụ dị ya mma. Nne ụmụaka ahụ bụ Ijeoma Emeoha kọwara na nke a mere mgbe ya bụ Pastọ sị ka ya kpọtara ya nwa ya nke gbara afọ iri ka ọ lokọta nwanne ya anya n'ebe a na-ekpere ya ekpere na chọchị ya. Nwan ya nke ahụ a na-ekpere kpere nwere nkwarụ n'ọkpa ya bụ nke mere ka ọ kwụsị akwụkwọ. Ijeoma kwuru, na ""pastọ ahụ na-akwasa nwa m ikpo chọwara nwa m nke nta mgbe ike nke ọzọ gwuru ya"". O kwuru na ya chọpụtara ihe mere mgbe obara si na ahụ nwa ya apụta. N'okwu ya, Olando Ikoku sị na ya bụ Pastọ ghọgburu nwa ahụ ịkweta na ịkwasa ya iko bụ naani ụzọ ọ ga-esi gbakee na ya bụ ọrịa. Sowore na Dasuki enwerela onwe ha Gọọmentị atọhapụ onye mkpọkọta otu 'RevolutionNow' bụ Sowore na onye bụbụ onye ndụmọdụ na nchekwa bụ Sambo Dasuki. Ọ bụ ọkaiwu ukwu nke gọọmenti etiti bụ Abubakar Malami nyere iwu sị ka ndị ụlọọrụ nchekwa DSS tọhapụ ha. Nyocha akụkọ ị nụrụ maka Naịjirịa - Buhari gwara Amerịka Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala mba Amerịka ka ha sie imi n'ala mara ebe ha si enwete akụkọ banyere Naịjirịa dịka ọtụtụ ha bụ akụkọ nduhie. Nke a na-abịa dịka Amerịka tinyere aha Naịjirịa na mba ndị na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi ha. N'ofesi Mba India ewepụtala akwụkwọ ọnụọgụgụ ọhụrụ n'agbanyeghi ngagharịiwe ndị mba ahụ mere megide iwu ịbụ nwa amaala. Gọọmentị India sị na akwụkwọ a ga-egosi mmadụ ole ka ndụ ma nyekwa aka iji hiwe iwu ọhụrụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ọgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa Gunmen raid: Buhari etiela Jonathan aka n'obi Onyeisiala Buhari etiela Goodluck Jonathan aka n'obi maka ndị ojiegbe wakporo ụlọ ya n'Otuoke dị na Bayelsa steeti. Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Tuzde kwuru na ndị oji egbe wakporo ụlọ onye chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ụbọchị Monde ma gbuo otu onye agha Naijiria. Akụkọ kwuru na Jonathan anọghị n'ụlọ oge mkpamkpa ahụ kpara mana ọnụ na-ekwuru ya bụ Ikechukwu Eze, gwara onye ntaakụkọ BBC na ya bụ mwakpo mere n'ụlọ nchekwa dị nso n'azụ ụlọ Jonathan ya Buhari onye kpọrọ Jonathan n'ekwentị kwuru na ọ bụ ihe obi mgbawa.O tokwara ndị agha Naijiria maka ịgba mbọ hụ na- ha gbochiri mkpamkpa kara ịkpa. Ọ bụ ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu gbara ama nke a n'ozi o wepụtara. Bọjeetị Enugwu steeti Gọọmentị Enugwu steeti nke Ifeanyi Ugwuanyi nọ n'isi ya edepụtala ijeri otu narị naịra na iri isii na itoolu dịka ego ha ga-eji rụọ ọrụ nke afọ 2020. Ọ mapụtara otu ijeri iji rụnye ụlọmposi na gburugburu steeti ahụ, iji sonye gọọmenti etiti n'ọgụ ịkwụsị nnyụsasị nsị ebe niile n'afọ 2025. A tọrọla onye ụlọọrụ WAEC Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ojiegbe atọrọla otu onye ụlọọrụ WAEC na mmadụ atọ ọzọ n'Ondo steeti. Dịka akụkọ a si kwuo, ndị ntọrọ a akpọọla oku ka a kwụọ ha nde iri abụọ tupu ha atọghapụ ndị ha ji. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 25 Ihe ruru ndị ọrụ gbatagbata 120 na-enye aka ịzọpụta ndị mmadụ Ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise anwụọla ebe mmadụ iri na atọ ọzọ merụrụ ahụ ka otu bọọsụ makpuru n'ime mmiri n'Indoneshia. Ka ọ dị ugbua, a ka na-enyo ihe kpatara ihe mberede a mere n'ụzọ Liku Lematang, dịka e zipuru ndị gbatagbata ka ha nyere aka ịchọta ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Manchester United a ga-azụ onye ọhụrụ? Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Man Utd esonyela na ndị na-agba ọsọ ịzụta Erling Haaland n'aka ndị Salzburg. N'otu aka ahụ, akụkọ na-ekwukwa na Chelsea na-akwado ịzụta Isco na-agbara Real Mdrid bọọlụ. 'Gọọmentị biko gbatara anyị ọsọ enyemaka n'Ọnịcha' Ndị na-azụ ahịa n'Ọnịcha 'head bridge' akpọkuola gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ọtụtụ ngwaahịa ha lara n'iyi n'ọkụ gbara ahịa ahụ ụnyaahụ. Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ metụtara ihe ruru ọnụụlọahịa iri anọ dị n'ọgbọ osisi, ọgbọ foam nakwa ọgbọ ji. Onyeisi ahịa ahụ bụ Sunday Obinze, kwuru na ọ na-eche na ọ bụ waya latrik malitere ọkụ ahụ. Ebe Collins Onwunali bụ odeakwụkwọ ndị ọgbọ ji, kwuru na obi dị ya ụtọ na ọkụ a ataghị isi mmadụ. Ngagharịudo na Delta steeti, Ụfọdụ ndị ọrụ Bekee a kwụsịrị ọrụ n'ike na Delta steeti n'afọ 2015 emeela ngagharịudo maka mmadụ narị anọ na iri ise gọọmentị steeti ahụ kpọghachitere n'ọrụ. Ha kwuru na aha ndị ahụ a kpọghachitere esoghi n'ihe karịrị mmadụ puku atọ gọọmentị kwụsịrị ọrụ n'ike mgbe ahụ. A chụọla onyeisi Boeing, Ndị ụlọọrụ Boeing achụọla onyeisi ha bụ Dennis Muilenburg ụkwụ eru ala, maka mkpọkasị ụgbọelu 737 Max abụọ kpọkasịrị n'afọ a. Ndị Boeing kpọpụtakwara aha David Calhoun dịka onye ga-anọchi ya, mana ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha nwụrụ n'ihe mberede ahụ ekwuola na onye ọhụrụ a amasịghị ha. Ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu, A nwụchiela otu onye na-akwado Chelsea maka iji ịkpa oke agbụrụ kparịa Son Heung-min na-agbara Tottenham bọọlụ. Ndị uweojii kwukwara na ha nwụchiri mmadụ isii ndị ọzọ maka mkparị a, ụbọchị Chelsea meriri Tottenham na be ha. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Christmas Carol: Lee etu ndị dara ogbi si a bụ abụ ekeresimesi" afirika-44458538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44458538,Ụlọikpe amaala Dariye ikpe imefu ijeri naira 1.6,"Ụlọikpe ukwu dị na Gudu, Abuja ,isiobodo Naijiria, amala onye bụbu Gọvanọ Plateau bụ Joshua Dariye ikpe imefụ ike ijeri naira 1.6, ego maka idozi ihe mbize mebiri.","Joshua Dariye chịburu dịka Gọvanọ Plateau steeti si na otu PDP banye APC n'afọ 2016 Jọstis Adebukola Banjoko nke ụlọikpe a dị n'Abụja makwara Dariye ikpe maka mmerụaka dịka o siri metụta nde narị naira 250 nke e nyere ụlọọrụ Pinnacle Communications site n'ego maka idozi ihe mbize mebiri. Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ kwupụtara nke a na Twitter. End of Twitter post, 1 Akụkọ ka na-abịa" afirika-45316136,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45316136,Emepeela akwammiri Third Mainland,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Akwammiri Emepeela akwammiri third mainland e mechiburu maka inyocha ọnọdụ ya. End of Twitter post, 1 Ọchịchị Legọs kelere ndị mmadụ maka ndidi ha nwere n'ime ụbọchị atọ e mechiri akwa ahụ. Gụọ maka ya n'uju ebea: Third Mainland Bridge: Anyị ga-ata ahụhụ N5000 gọọmentị na-akwụ Aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti na-enye ndị nọ n'ụbịam puku naira ise kwa ọnwa. O kwuru na ọ ga-aka baa uru ma enye ndị ntorobịa otu nde naira iji chọta onwe ha. Gụọ ya n'uju ebea: 'Nye ndị ntorobia N1m' - Peter Obi Na mba ofesi, Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ ga-agbasi mbọ ike ịhụ na mba Zimbabwe ga-adịrị mma na-aga n'ihu. O kwuru nke a ka e duru ya iyi ọrụ dịka onyeisiala mba ahụ taa. N'egwuregwu, E bupuru Michael Keane na-agbara Everton bọọlụ ka ọ tawara isi ya oge ya na onye otu ya bụ Idrissa Gueye kụkọtara isi taa. E bugara Keane ụlọọgwụ ka nkeji isii a na-elekọta ya n'ọgbọ egwuregwu gachara Ebe Chelsea ji ọkpụ abụọ a satara otu merie Newcastle na St James's Park taa. Eden Hazard bu ụzọ were penariti nye goolu na nkeji 76, ebe Joselu sara ya na nkeji 83 tupu DeAndre Yedlin bụ onye Newcastle agbakpuo bọọlụ na neetị nke ha na nkeji 87. Mmeri a pụtara na Chelsea enwetala mmeri atọ n'ime egwuregwu Premier League atọ ha gbarala kamgbe Maurizio Sarri bidoro ịchịkọta ha. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụkọchukwu Jenny Kenny gwara BBC Igbo na ọ bụ chukwu kpọrọ ya okwu, nke mere ya ji jiri egwu agwọ ọrịa. Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia" afirika-47535336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47535336,Emeka Ihedioha: Uche Nwosu ọ ga-aga n'ụlọikpe?,Akụkọ na-eru anyị na ntị ugbua bụ na Uche Nwosu zọrọ ọkwa ọchịchị n'Imo steeti nwere ike ịga ụlọikpe.,"Site n'ihe o kwuru n'elu Facebook ya, Nwosu kwuru na e zupuru ike ọchịchị n'aka ya, ma kwuo sị na ọ ga-anapụta ya; ma kwuo na ọ na-agbado ụkwụ n'ihe iwu obodo kwuru maka usoro e ji akpọpụta onye nwetara mmeri. O kelekwara ndị Imo na ndị na-akwado ya maka etu ha sị kwụnyere ya n'oge ntuliaka. Lee ihe o dere ebe a: Content is not available End of Facebook post, 1 Ọ gwakwara BBC Igbo ihe ọ ga-eme maka mkpebi ụlọikpe. Gere ya ebe a: Aga m anabata mkpebi ụlọikpe mgbe m garuru - Uche Nwosu Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49705854,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705854,Igbo People: Ihe 10 mere ndị Igbo ji akpa ike n'akụkụ ụwa ọbụla ha nọ,Che che che che Igbo Kwenu!!!!! Yaaaaa.,"Igbo nwere Ebu nwe Nfụ Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo na-ekwu ọtụtụ mgbe n'obodo ọbụla ị gara ma ị na-ahụghị onye Igbo, mara na ya bụ ebe adịghị mma obibi. N'agbanyeghị na ndị Igbo bụ ndị pekarịcharịsiri mpe n'agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa, ha nọcha n'akụkụ mba ụwa niile. Mana ọ ga-adị mma ka anyị leba anya mara ihe na-aka ndị Igbo obi n'ebe nille ụwa soturu. 1.Okwukwe n'ime ụmụ ha Chigozie Oguine bụ onye ji ego achụ ego na mba Amerịka kamgbe afọ iri abụọ kwuru na okwukwe ndị Igbo nwere n'ebe ụmụ ha nọ so ebunye ha iru ọma ebe ọbụla ha nwetere onwe ha. O kwuru na onye Igbo ọbụla mụrụ nwa na-enwe okwukwe siri ike na nwa ahụ ga-emeriri ọfụma ebe ọbụla ọ gara, ya mere mmụọ ọma ji eso ndị Igbo. 2. Igba mbọ I chetara mgbe anyị wetara ụnụ akụkọ onye Igbo na-azụ ahịa mgbuka na Johanesburg. Johanesburg: ""A chụrụm n'ọrụ mana a bụzịm onye na-enye ọrụ na South Africa"" Ezenwa Ozoigbo dị afọ 30, na-ekwu na mgbe ọ bịara na mba South Afrịka, na echiche na onweghị onye ga-enyere ya aka na mba ahụ mere ya ka ọ gbasie mbọ ike. Mbọ ọ gbara bụ na ọ na-arụ ọrụ ma na-edowe ego ọ tụkọtara na kom kom rue mgbe o zuru ịmepe ụlọahịa nke ya. N'ọnụ ya, ""Onye Igbo na-eche maka echi makana ọ chọghị ịbụ ohu kwa mgbe mgbe."" 3. Ha achọghị ịkụda obi nne na nna ha zipuru ha Nneamaka bụ onye Ezinifite dị n'Anambra steeti bi mba Amerịka Onye Igbo ọbụla nwere ezinụlọ o si wee pụta. Ebe ọbụla o mechara nwete onwe ya, ọ gaghị achọ ka ọkụda obi ndị bee ya tụmadị nne na nna ya zipuru ya. Nke a mere ka Nneamaka Fidelis, onye bụrụla nọsụ na mba Amerịka gwa BBC Igbo na ọ ga-agbagide mbọ bụrụkwuo Dọkinta ahụike na mba ahụ. 4.Nwanne gosi m 'way' Apprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka Ọ bụrụ na ị bụ nwafọ Igbo ma ihe a na-akọ, ị ga-anụtụgo okwu 'nwanne gosi m way'. Ndị Igbo na-enwe anụrị pụrụiche ma ha hụ nwanne ha na mba ọzọ nke a na-emekwa ka ha nyere onwe ha aka. Ọ bụ agwa hụ bụ ihe bidoro usoro ịgba boy n'ala Igbo nke na-euzi ewu n'ụwa niile. 5.Ha anaghị atụ egwu ilu nwaanyị maọbụ dị na mba ọzọ Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya Onye Igbo ruo mba ọzọ, ọ dabara ya na nwaokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla, ha lụwa onwe ha. Ọ ga-amụta ụmụ na mba ahụ na bawanyezi. 6.'I na-enye m nri?' Ụfọdụ ndị Igbo bi na South Afrika na-agbasi mbọ ike Ọ rara ahụ ị hụ onye Igbo na-arịọ arịrịọ makana ọdịghị ume ngwu. Kama onye Igbo ga-arịọ gị nrị ikparịa ya, o je kpo nsị ma nara ego ya. Onye Igbo ga-achọ kiri kiri ọrụ na-arụchara wee na-eche ihe o na-eche ma nwekwa okwukwe na nkiru ka mma. 7. Iwulite akụ na ụba obodo ha bi na ya Ndị Igbo anaghị agba ""last"". Ha ga-achọrịrị imezi obodo ha bi n'ime ya ma soro wulite akụ na ụba obodo ahụ. Ya kpatara ebe ọ bụla onye Igbo gara ọ ga-edozi ụzọ maọbụrụ na ụzọ adịghị ma rụkwa ụlọ karaaka n'agbanyeghị na ọ bụghị be ya. Ernest Ezeajughi: Etum si bụrụ Mayor na London. Agwa a na-eme ka ndị ha bi n'obodo ha nye ha ohere ịbanye ọchịchị obodo ahụ. 8.Ha na-amụkarị asusụ na omenala obodo ndị ha bi ya Onye Igbo ga China, ọ ga-agba mbọ mụta asụsụ na omenaala ndị ọ nọ na be ha, ka ihe na-adabara ha nkeọma. 9. Ị ma aka ziri ezi Ebe ọ bụla ndị Igbo nọ, ha na-chọ ka ha ṅomie ihe di mma ndị obodo ahụ na-eme nwalee ma ha ga-emeli ya bụ ọkaibe. Ụfọdụ oge, ka atụmaatụ a na-eweta anya ụfụ mana onye ma ihe ọ na-eme achọghịkwa ịma. 10. Ọnatarachi Ọtụtụ ndị nọ na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ọnatarachị na ndị Igbo ga-atọli ute dịnara ebe ọbụla ha nwetere onwe ha n'ụwa ma sịkwa n'ọnọdụ ahụ mepụta ihe dịmma ga-abara ha uru. Dọkịnta Chigozie Oguine na-ekwu na ihe nwereike ikpata nkea bụ na ụmụ Igbo nwere okwukwe na Chukwu nwe ụwa niile. Akụkọ ga-akpalite mmụọ gị: Ihe chere ndi si South Africa lọta" afirika-47924998,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47924998,"Facebook, Instagram outage: Facebook nyụrụ ka ọkụ taa",Akụkọ dị n'elu taa,"Facebook Nyụrụ ka ọkụ taa Ụnụ achọpụtakwara e, na Facebook, Instagram na messinger nyụrụ ka ọkụ ihe ruru awa atọ taa. Nsogbu a malitere ihe dị ka elekere iri na otu nke ụtụtụ a mezikwara n'elekara abụọ nke ehihie. Ebe ndị ọrụ ha ekwughị ihe gbatara nke a, ha rịrọ mgbaghara. Mmechi keke n'Abịa Akụkọ ruru BBC Igbo nti site Abịa steetị na-akọwa na ndị njem tọọrọ n'ụzọ n'abalị Satọde maka mechi nwamgbenta gọọmentị mechiri keke na steeti ahụ. Kọmịshọna mgbasa ozi bụ John Okeiyi kwuru na ụnyaahụ bụ ụbọchị mbụ ebidoro ya bụ amụma nke gọọmentị tụrụ anya na ọ ga-ebelata ohi na mpụ na steeti ahụ. Nwaagbọghọ agbagburu na Legọs Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Na steeti Legọs, onye uweojii agbarala nwaagbọghọbịa tụọ ma merukwa nwa nwoke ya na ya yi ahụ n'Ajagunle. Onyeisi ndị uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu enyela iwu ka anwụchikọ ndị otu ha gburu Ada Ifeanyi na merukwa Emma Akomafuwa ahụ. Manchester City ji ọkpụ goolu atọ charaacha nyụọ ndị Cyrstal Palace ịkpakwụ taa n'Asọmpị premier League ebe Chrystal Palace ji otu ọkpụ gosi na ọ bụ nwoke na ibe ya lụrụ ya bụ ọgụ. Gee Nkeji Igbo ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Atiku gwara APC Onye zọrọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar asaala atamụmatụ patị APC weputara n'ụloikpe nke n'akọwa na site n'ebe amụru ya, onweghi ikike ịzọ ọchịchị onyeisiala na Naịjirịa. Atiku si n'okwu a enweghi isi nke oji nwee ọdụ, ka APC chọba ihe ọzọ ha ga-ekwu. Rifkatu Galang, onye atọọrọ mgbe ọ dị afọ 17 n Chibok ka nọkwa n'aka ndị ntọọrị Ụfọdụ ụmụ Chibok ka nọkwa n'aka Boko Haram Taa mere ya afọ ise ndị omekome Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ na gọọmentị Girls Secondary School nke dị na Chibok, Borno steeti. ụbú n'abalị ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa Apreelụ 2014 ka tọọrọ ụmụakwụkwọ karịrị narị abụọ n'ụlọ akwụwkọ ha. Kamgbe ahụ, enwetala otu narị na asaa n'ime ha mana ihe karịrị narị ka na-efu efu. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:Nne na nna ụmụ Chibok etinyela nchekwube n'aka TB Joshua Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ofesi, Pati anọghị n'ọchịchị na mba Amerịka enyela gọọmentị onyeisiala Donald Trump ruo ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Epreelu ka o nye ha akwụkwọ oji kwụọ ụtụ isi. Pati Demokrat nyebụrụ Trump ubọchị nke iri nke ọnwa a ka ome ihe ha kwuru mana ọgbajụrụ ha. Pogba gbakpuchara goolu ha abụọ N'egwuregwu, Manchester United pụtara ka nwachinemere ụnyaahụ mgbe ha zutere West Ham n'ọgbọ egwuregwu Old Traford. Ọ bu penariti abụọ otu ugo ha bụ Pogba jiri mee ihe nyere Manu ọnụ ha ga-eji kwuo okwu ka agbachara ya bụ asọmpị. Gụọ nke a n'uju ebe a: Man Utd alaala na nta Gee njeki ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyi nke taa: Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile" afirika-55042357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55042357,Ihe mere ozu ụmụaka atọ nwụrụ na Itchi dị na Nsukka,"Ihe nkiri na-efegharị n'elu soshal midia na-egosi etu e si e bupute ozu ụmụaka nwụrụ n'obodo Itchi dịketere dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze South, Nsukka, Enugu steeti na-ebuba ya n'ụgbọala ndị uweojii.","O nwebeghị onye ma etu ụmụaka ahụ si nwụụ mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu steeti kwuru na ha na-enyocha ọnwụ ụmụaka ahụ. Content is not available End of Facebook post, 1 BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ nne maọbụ nna ụmụaka ahụ gbasara ihe kpatara ọnwụ ha. Otu onye zara Chijikem Ugwuanyi na Facebook wepụtara ihe onyonyo ahụ na facebook ma na-ajụ ihe gburu kịrịkịrị ụmụaka atọ ahụ. Onye wenitere isi n'okpuruọchịchị Igbo Eze South na-achọghị ka-akpọpụta aha kwuru na o nweghị ihe ọma ma maka ya bụ okwu makana a ka na-eme nyocha gbasara ihe e kwuru mere ebe ahụ. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43665478,https://www.bbc.com/igbo/43665478,Offa: Ndịohi egbuola mmadu 17,"Mmadụ karịrị mmadụ iri na ise anwụọla, n'ime ha ndị uweojii itoolu mgbe ndịohi bu egbe wakporo ụlọakụ ruru ise n'obodo Offa dị na Kwara steeti ụbọchị Tọọdse.","Ihu otụ n'ime ụlọakụ ndị a wakporo Ndị nọ ebe ihe a mere sị na ndịohi ahụ ji ogbunigwe gbawa ebe ụlọakụ ahụ na-echekwa ego mmadu tupu ha-eburu ya pụọ. Ha kwukwara na ndị a bu ụzọ ga n'ụlọọrụ ndị uweoji gbagbuo ihe niile ha hụrụ ebe ahụ tupu ha gaa ebe ụlọakụ ndị ahụ dị. Ha gbakwara mbo gbochie ụzọ abụọ batara obodo ahụ si na Ilorin n'Osogbo, obodo ndị agbatobi dị nso n'Offa. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ajayi Okasanmi (DSP) onye kwuru na nke a bụ ezie kwukwara na ndị omekome ahụ gburu ndị nkịtị asaa. Akụkọ ga-amasị gị Ihe a wutere ndị mmadụ nnukwu dịka ha gosiri n'elu atụmatụ mgbasa ozi:" afirika-43882572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43882572,Akụkọ kachasị taa: Buhari akatọọla ọnwụ ndị Fada na Benue taa,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Ndị uweojii n'Enugwu na-emebi ogbunigwe echi Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha ga-emebi ogbunigwe a chọpụtara liri n'ala site n'oge agha. Akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha ga-ebido imebi ogbunigwe ahụ echi. Ndị ọchịehi egbuola ụkọchukwu abụọ na ndị ọzọ Onweghị onye kweta na ihe ga-egbochi nsogbu gbasara ịchị ehi Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu e gburu ndị ụka Katọlik na Benue taa. Ndị ochiehi wakporo ụlọụka St Ignatius nke ndị katọlik wee gbuo ndị fada abụọ ndị na-aka ụka ebe ahụ. Akpọrọla Dino gawa Lokoja Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino Okwu dị n'etiti ndị uweojii na Sinetọ Dino Melaye abala agba ọzọ. Ndị uweojii kpọrọ Melaye gawa Lokoja taa, ihe ndị mma na-ajụ bụ ma a ga-akpọgharị ya n'etiti ndị ohi? Na mba ofesi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Iran aka na ntị gbasara ngwọagha nuklia. Trump bụ onye na-ele onyeisi mba France bụ Emmanuel Macron ọbịa kwuru na nnukwu nsogbu ga-adịrị Iran ma ha bidogahrịa imepụta ngwọagha nuklia ọzọ. N'egwuregwu Liverpool ga anabata ndị AS Roma taa n'asọmpi ọkara ikpeazụ Uefa Champịọns ụkwụ nke mbụ ya. Mohammed Salah nke Liverpool ga-enwe ohere izute ndị AS Roma bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ n'oge gara aga. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017. Naeto C: Ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42929959,https://www.bbc.com/igbo/42929959,"Na Ekiti Steeti, a kpụgala ndị Fụlanị na-achị ehi abụọ ụlọikpe","Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka nchekwa akpọrọ 'Department of States Service, (DSS)' na-aha bekee kpụpụrụ Namajo Mohammadu, 32, na Abubakar Abase, 18, n' ụlọikpe nta dị na Ado-Ekiti maka igbu mmadụ na iji egbe ga ohi.","Nsọgbu dị n'etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ụgbọ atala ọtụtụ mmadụ Onye nọchitere anya DSS bụ Olaoluwa Olatunbosun kwara ụlọikpe na ndị a eboro ebubo mere nke a ka ọnwa Jenuwari dị iri na asatọ n'Ido-Ekiti. O kwuru na ndị a ji egbe na ngwa ọgụ ndị ọzọ gburu otu nwaanyị Tiv dị ime, oriakụ Muwaga Felix n' ugbo ya. Olatunbosun kwukwara na mmadụ abụọ ahụ zukwara ndị obodo ahụ ohi. Dịka o siri kwuo, mpụ ahụ megidere agba nke 516, 402 and 319 nke iwu megidere mpụ a na-akpọ, 'Criminal Code' na bekee. Ọ gara n'ihu rịọ ka a tuụnye ha na mkpọrọ ganye na e mecha nchọpụta. Onweghị onye ọkaiwu nọchitere ndị a eboro ebubo. Onye ọkaikpe bụ Ropo Adegboye nyere iwu ka a hapụ ha n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ganye e mecha nchọpụta, ma wugharịa ikpe ahụ mgbe ọnwa Februarị ga-agba iri abụọ na asatọ." afirika-44446993,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44446993,"""Enyi nwaanyị onye agbataobi anyị kpọrọ ya pụọ""",Nne nwa afọ abụọ furu kemgbe Mee 1 na-ayọ ọha enyemaka ịchọta nwa ya.,Kamgbe ahụ ezinaụlọ nọ na nnukwu nwute gbasara ọfufu nwa ha. Ndị ụweojii BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ na-ekwu na ha anwụchiela mmadụ abụọ bụ enyi nwaagbọghọ nwa ha furu n'aka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 44699337,https://www.bbc.com/igbo/44699337,Budget 2018: Ndị na-eme ngaghariwe chọrọ ka Saraki na Dogara rituo n'ọkwa,"Ọgbaghara dapụtara n'ụlọomeiwu ukwu dị n'Abuja dịka ndị na-eme ngagharị iwe wakporo ebe ahụ na-ekwu ka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na ogbo ya nke ụlọomeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara, tinye akwụkwọ arụkwaghịm.","Ndị otu a kpọrọ 'Citizens' Action to Take Back Nigeria (CATBAN)', n'ụbọchị Tuusde, Julaị 3, na-ebo ndị ụlọomeiwu ebubo izupụ ego a kwadoro maka ọrụ na mpaghara ha na-anọchite nakwa iwepụ ego ma tinyekwa ebe ụfọdụ na Bọjetị 2018. Ụfọdụ ozi dị n'akwụkwọ ha ji egosi iwe ha na-ekwu sị: Saraki, tinye akwụkwọ arụkwaghịm, kwụsị ịkwa ndị nwụrụ anwụ emu; ""Ndị ụlọomeiwu si azụ ụlọ etinye ihe na bọjetị emetọọla ọrụ ndị ụlọomeiwu kwesịrị ịrụrụ ndị ha na-anọchite, o kwesịrị ka a hazigharịa ya."" Onyeisi otu ahụ bụ Ibraheem Wala, kwuru na aka ndị isi ụlọomeiwu adịghị ọcha ịnọ n'ọkwa ha. Wala kwukwara, ""O doro anya na ihe ha gbakwụnyere na bọjetị dị nnukwu nke gosiri oke mpụ nke mkpakwasa ụkwụ ya bụ ịhazihari bọjetị."" Ọ kpọrọ oku ka a nwụchie ma kpụpụ n'ụlọikpe ndị mere mpụ a n'ụlọomeiwu." afirika-45154121,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45154121,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Onye ntọọ ṅụrụ Tramadol arahụọla ụra abalị isii,Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụtụtụ a,"Onye ntọọ na-arahụ ụra Tramadol n'ụra ka na-eme Ọ gara ntọọ, ụra tọrọ ya Ndị uweojii n'ondo steeti ekwuola na onye ha na-enyo enyo dịka onye ntọọ ha nwuchiri ebe ọ na-arụhụ ụra n'ihi Tramadol ọ nwụrụ ka nọ n'ụra abali isii aka jiri kparacha ya. Nwoke amabeghị aha ya na ndị otu ya gara ịtọrọ mmadụ n'ụlọahịa ọgwụ, onye ha wakporo gbalahụrụ ha, ma ụra buru nwoke ahụ n'ebe ihe ahụ mere. Ndị uweojii kwuru na e nwetara tramadol dara ram narị anọ(400gm) in ime akpa ya. Na nke dịka ibe ya, ndị ji egbe tọrọ mmadụ iri na asatọ n'okporoụzọ sị Owere gawa Pọthakọt ụnyaahụ. Ohaneze sị na ha akwadoghị mmachi Ipob Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo ekwuola na aka Ohanaeze adịghị na mmachi gọọmenti etiti machiri Ipob. Nwodo kwuru nke a dịka otu Ipob gụpụrụ onwe ha na mbọ ikpe udo n'etiti otu abụọ ahụ. Ọnụ ego mba Tọki ejirila pasent iri na anọ gbadata Onyeisiala Tọkị bụ Recep Tayyip Erdogan kpọrọ mmachị Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump machiri ahịa igwe si Tọkị 'agha' Nke a mere oge onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump tinyechara ego n'ụgwọ ha na-ana n'igwe e siri mba Tọki bubata Amerịka. N'egwuregwu, Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Manchester United bụ Jose Mourinho etoola Paul Pogba maka idu otu ahụ na mmeri ha meriri Leicester Csity na asompi ha mere ụnyaahụ. Man.U ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Leicester an asompị mbụ na Premier league n'afọ a. Lee ihe nkiri kirie maka ọdịmma ahụike gị na ezinaụlọ gị: Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47601416,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47601416,"Gbanweenụ ""Electoral Law"" na Naịjiria - Ndị ụkọchukwu Katọlik","Ndị otu ụkọchukwu ụka Katọlik Naịjirịa enyela gọọmentị ndụmọdụ ka o binye aka ""n'Electoral Law"" ọhụrụ, na ọ bụ nke a ga-eme ka nsogbu kwụsị ịdapụta na ntuliaka.","Ha wepụtara ya bụ ozi ka ha mechara nzukọ ""Lent"", ma kpọkuo ndị niile dara ntuliaka na-achọ ịga ụlọikpe ka ha were usoro udo na-azọ ihe ha kpọrọ orubere ha oge niile. Otu ahụ kpọrọ onwe ha ""Catholic Bishops Conference of Nigeria CBCN"", gwara ndị niile nwetara mmeri na ntuliaka gara aga, ka ha gbakwasa ụkwụ n'inye ndị mmadụ ihe e ji enyere ndụ aka. Ha kwuru na oge ""lent"" bụ mgbe ihe ọhụrụ ji amalite, wee gwa ndị ụka ka ha malite ibu ọnụ, kpee ekpere dị nkwadebe maka mbilite n'ọnwụ nke Kraịst. Ozi ahụ bụ nke a gụpụtara n'ụka Katọliki niile na Naịjiria n'ụbọchị Maachị 17, 2019, iji mee mmemme ụka nke abụọ na Lent. Ha kelere Bishop Ignatius Kaigama nọbu na Jos ma bụrụzịa onye ezigara Abuja dayọsis." egwuregwu-43095861,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43095861,Federer abụrụla onye mbụ kacha kaa nka na tennis,"Roger Federer ekwuola sị na ịbụ onye kacha kaa nka bụ onye mbụ n'ọkwa a na-agaghị echefu echefu n'egwuregwu tenis - afọ iri na anọ kemgbe o ruru n'ọkwa ahụ mbụ - bụ ""atụmanya m bịara na mmezu"".","Roger Federer bidoro iji tenis mere akaọrụ n'afọ 1998, oge ọ dị afọ iri na asaa Federer dị afọ iri atọ na isii, ji 4-6 6-1 6-1 merie Robin Haase n'ime agba nke asatọ n'ime asọmpi Rotterdam Open, nke mere o ji nọchie Rafael Nadal dị afọ iri atọ na otu, n'elu ọkwa. Ọ gafekwara Serena Williams, onye dị afọ iri atọ na ise oge ọ dapụrụ n'ọkwa mbụ nke ụmụnwaanyị n'ọnwa May 2017. Federer kwuru,""Nke a kacha bụrụ ihe nye m n'afọ iri atọ na isii, fọrọ ntakịrị ka o ruo iri atọ na asaa."" ""Ị kawa nka, ị ga-etinyekwu uchu n'ọrụ karịa etu isi emebu mbụ. Ị ga-agba mgba ịnapụta ya onye rụsiri ọrụ ike irute ebe ahụ. ""Ịbụ onye mbụ bụ mmezu ebumnobi onye ọbụla na-apịa tenis. Ọ bụ ihe ịtụnanya inweta ya. Inweta ya ebe a bụ ebe m nọ nweta ohere m nke mbụ, kachasị bụrụ ihe nye m."" Federer bu ụzọ ruo onye mbụ n'ọkwa tenis n'ọnwa Febrụwarị 2004, mana ọ kwụsịrị ibụ mbụ n'ọkwa na Oktoba 2012 ma gbadaruo iri na asaa na Jenụwarị 2017. N'agbanyeghị ya, o buliri iko asatọ gụnyere Wimbledon na Australian Open abụọ kemgbe ahụ." afirika-45063199,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45063199,Kedụ ka ndị Igbo ga-esi na-azọ Eze ndị Igbo n'ala ọzọ?,Otu ụlọikpe na Kano agwala Eze Ndigbo Kano bụ Boniface Ibekwe ka ọ kwụsị ibugharị onwe ya dịka ezigbo Eze Ndigbo na steeti ahụ rue mgbe a ga-ekpebi ikpe gbasara ya.,"N'akwụkwọ ikpe Ezedioramma nke ise na Kano steeti bụ Ikechukwu Akpudo gbara n'ụlọikpe ahụ, ọ na-achọ ka Ibekwe na ndị otu ya kwụsị ịkpọ onwe ya Eze Ndigbo na Kano n'okpuru otu Igbo Community Association (ICA) n'aha ịchafụ. Iwu ụlọikpe ahụ kwukwara ka Ibekwe kwụsị ibugharị maọbụ ibupu onyinye maọbụ ihe ọbụla nke otu ICA Kano nwee nke gụnyere ala, ụlọ, ụlọahịa na ngwongwo ndị ọzọ. A ga-ekpe ikpe ahụ n'ọnwa Sepụtemba. Mana nke a abụghị mbụ ndị Igbo na-azọ eze na mba ọzọ nke mere na ọtụtụ ndị Igbo akpọọla oku ka a kwụsị ichi echichi eze ndị Igbo na mba ọzọ na-abụghị ala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44711906,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44711906,#Nigerianlivesmatter: Ndị na-eme ngagharịiwe wakporo Unity Fountain,Ụmụafo Naijiria na ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye pụtara n'igwe na Unity Fountain dị n' Abuja taa igosi iwe ha banyere oke ogbugbu mmadụ na-eme n'akụkụ Naijiria dị iche iche.,"Ndị Katọlik mere ngaghariwe megide oke ogbugbu mmadụ na Legos na nsonso Ha kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka o me ngwa ngwa kwụsị oke nkwafu ọbara na-eme na Platu, Benue, Taraba, Kaduna, Zamfara na ebe ndị ọzọ. Ha gwakwara ya ka ọ hazigharịa ndị ọrụ nchekwa ala Naijiria. N'okwu ya, onye otiegwu a ma ama bụ Charly Boy kwuru na ihe ha bịara Unity Fountain ime bụ ịgwa gọọmenti na 'oke ogbugbu mmadụ ahụ ezuola, na iberibe ndị \naijiria ezuola.' Otu onye n'ime ha bụ Gbenga Sesan kwuru n'igwe okwu Twitter ya na ngaghariwe ahụ bụ iji tie mkpu ka oke ogbugbu mmadụ ahụ kwụsị. Lee ihe ndị ọzọ soro gaa ebe ahụ na-ekwu maka ya na Twitter: Lawal Lateef kwuru na ""naani ihe anyị na-arịọ bụ kwusị oke ogbugbu mmadụ.""" afirika-44206956,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44206956,Ohaneze ekwuola ihe ha chọrọ ka e mere ha na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa n'ụtụtụ a,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Ihe ndị Ohaneze chọrọ Ndị Ohaneze Ndịgbo ewepụtala ihe ha chọrọ ka e mere ha. Ha bụ: otu agba ọchịchị afọ isii maka onyeisiala na ndị gọvanọ. Ka e kepụtakwuo otu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Ka ekpochapụ atụmatụ okpuru ọchịchị ma kwụsị ihazi akụnaụba steeti ndị nwere onyinye Chukwu. Lai Mohammed abịala ọzọ O kwuru na a na-achọ ihe ruru tarị naịra asatọ n'ọma furu n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze Ebe ọzọ na Naịjirịa Lee webusait e ji nde naịra 64 we hazie Ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjirịa ji nde naịra iri isii na ise wee wulie webusait ha. Akụkọ mba ofesi Ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'ihe mberede a. A ga-aka ụka ncheta maka ndị nwụrụ n'ogbunigwe a tụrụ na Manchester mba UK n'afọ gara aga. Cheta na mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ n'ogbunigwe ahụ Salman Abedi tụrụ. N'egwuregwu Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Arsenal Otu egwu bọọlụ Arsenal akwadola iwebata Unai Omery dịka onye nkuzi otu ahụ. N'aka nke ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ Athletico Madrid eruola Uyo maka asọmpi enyi na enyi ha na Super Eagles ga-agba taa n'ọgbọ egwuregwu Godswil Akpabio. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ogbaghara ndị IPOB" afirika-52548683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52548683,NBS 2019 Poverty and Inequality Report: 'Anyị amaghị ebe NBS sịrị nwete mkpebi ha maka Ebonyi',Igbo kwuru si na ekwe kwụọ ama agbaa.,"Okwu a pụtara dịka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgụgụ akpọrọ ""National Bureau of Statistics"" wepụtara etu ubiam si dị na steeti dị iche iche na Naijiria. Mwepụta a gosiri na Ebonyi steeti kacha bụrụ steeti nwere ndị ogbenye na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Dịka ha nwere pacenti iri asaa na itolu na ụma bụ ndị ogbenye. Etu a ka ọ dịkwa ha n'afọ abụọ gara aga. Guọ maka nke ahụ ebe a: Ebonyi so kachasị daa ụbịam na Naịjirịa. Anyị a na-ajụ ""ọ bụ na agụba adịghị nkọ ka ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ?"" Ihe Gọọmenti Ebonyi steeti kwuru BBC kpọtụrụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji maka ihe gọọmenti Ebonyi nwere ikwu maka nyocha a. Orji kwuru na ọcheghị na nyocha ndị ngalaba NBS mere zuru oke. O kwuru na enwere ọtụtụ ụzọ esi atule mmepe na ọdịnma ndị obodo. Orji kwuru sị "" Ọ bụrụ ahụike,ihe obodo ji ebi, agụm akwụkwọ, nchekwa obodo na ịkwalite ndị obodo bụ ụzọ ha siri mee ntule ha, ha mara na nke ahụ bụghị eziokwu"" O kwuru na Mgbe ngalaba ahụike WHO nyochara maka ụmụaka amụru ọhụru ị di ndụ, ha chọpụtara na nke Ebonyi steeti so na nke kacha mma. Orji kwukwara na ọ bụ mpaghara ọchịchị nke dị na Ebonyi steeti kacha bụrụ mpaghara nwere ndị bara mahadụm n'afọ 2017. O kwuru na ọbụghị ị ga ime obodo jụọ ndị mmadụ ego ole ha na-erete n'ahịa ma ọ bụ ụdịri ụlo ha bị, O kọwara na nke a abụghị ụzọ ziri ezi n'ihi na ndị Ebonyi steeti abụghị ndị anya ukwu. Ọ rụtụrụ aka na ụlọọrụ ngalaba NBS nke dị na Ebonyi na anọkarị na mgbachi, ma keduzie etu ha ga-esi rụọ ọrụ ha nkeọma. Ajụjụ kacha mkpa ugbua bụ kedụ etu ndị bi na steeti niile nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ụbiam? Kedụ etu ndị steeti ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ubiam? Ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo bụ Kachi Ononude tupenyere BBC azụ etu steeti nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ubiam okachasi n'Ebonyi steeti. Lee ihe okwuru. 1. Gọọmenti steeti ikwalite ndị steeti ha. Maazị Ononude kọwara na ọ dị mkpa ka gọọmenti steeti niile tinye uchu na ikwalite ndị steeti ha. O ji Ebonyi steeti were kọwaa na Gọvanọ Dave Umahi agbaligo ịrụpụta ihe dị iche iche eji enyere obodo aka dịka okporo ụzọ na ihe ndị ọzọ. Onye na-akọ osikapa Abakaliki Kama i lee anya, ọtụtụ ndị ntorobịa na-ere ihe n'okporo ụzọ steeti dị iche iche na abụkari ndị si Ebonyi steeti. Nke a gosiri na enweghị ọrụ maọbụ ihe ha ga-eji kwado onwe ha na steeti ha. Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Ononude kwuru ""Ebonyi bụ steeti Chukwu ji ihe ọnatarachi dị iche iche gọzie kama ọ naghị abara ndị steeti ahụ uru. Gọọmenti Ebonyi kwesịrị ihibe ụlọ ọrụ na arụpụta ihe ga-eme ka akụ ọnatarachi ndị a baara ndị Ebonyi uru."" Akụ ọnatarachi ndị a gụnyere nnu, osikapa, ọra igwe na ihe ndị ọzọ bụ ihe gọọmenti kwesiri iji kwalie ọnọdụ akụnụba ndị Ebonyi steeti. Ihe nchọpụta United Nations Development Programme (UNDP) biputara na Ọktoba 2018 gosiri na ọnụọgụ na-egosi ka ụbịam sị kwuru na Naịjirịa 2: Ụmụafọ steeti ihiwe ụlọ ọrụ na Steeti ha. Mazi Ononude kwuru na ọ dị oke mkpa ka ndị Ebonyi steeti nọ mba na obodo dị iche iche weghachi akụ ha n'obodo ha. Ọ kwuru si; ""I lee anya ị ga-ahụ etu ndị Imo steeti si mee ka Owere bụrụ ebe kacha nwee ụlọ oriri, ndị Ebonyi steeti nwekwara ike ime ka ejiri otu ụlọ ọrụ mara ha."" Nke a na-akọwa ka ndị Ebonyi steeti nwere ego were ego ha rụpụta ụlọ ọrụ dị iche iche iji nyere ndị steeti ha aka. Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru" afirika-50313833,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50313833,Appeal Court Judgement: Ụlọikpe mkpegharị enyela Ọrji Uzor Kalu mmeri,Ụlọikpe e nyela O.U.K mmeri,"Akụkọ ga-amasị gị: Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Owerri enyela aka chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu mmeri na ntuliaka ọkwa ịnọchite anya Abia North. Onyeisioche ụlọikpe a bụ R.A Ada kwupụtara mkpebi ụlọikpe a iji katọọ ikpe ụlọikpe nta bụ 'Tribunal' kpere na mbụ nke sị ka e megharịa ntuliaka n'ụfọdụ wọọdụ. Ọ sị na usoro ụlọikpe 'Tribunal' ji kagbuo mmeri Kalu abụghị ihe iwu kwadoro. Ọ gara n'ihu kwuo na onye mere mkpesa bụ Mao Ohuabunwa nke PDP enweghi ndị akaebe iji kwado mkpesa ya. N'otu aka ahụ Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Owerri nọrọ sị na ọ bụ sịnetọ Rochas Okorocha bụ aka chiburu Imo steeti meriri na ntuliaka ọkwa sịnetọ ịnọchite anya Imo West. Onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Ụlọikpe a kachapụrụ mkpesa Osita Izunaso nke APGA na Jones Onyereri nke PDP mere ma kwuo na ha achịtaghị aja. Onyeisioche ndị ụkaikpe a bụ R.A Ada gụpụtara nke a sị na ndị mere mkpesa a enweghi ihe akaebe n'ebubo ọgbaghaara ha sị mere na ntulaiaka ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe akaebe gosiri na a magidere onye ọrụ Inec n'ike ka ọ kpọpụta mpụtara ntuliaka. Cheta na ụlọikpe ntuliaka dị na mbụ chabie ikpe na ọ bụ Okorocha meriri na ntuliaka a e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị 2019. Mọnde bụ ụbọchị ezumike ndị ọrụ Bekee Gọọmentị etiti amapụtala ụbọchị Mọnde bụ abalị iri na otu ọnwa Nọvemba dịka ụbọchị ezumike nye ndị ọrụ Bekee. Odeakwụkwọ mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Mohammed Manga sị na nke a bụ maka emume Eid-ul-Mawlud nke afọ 2019. N'ofesi Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron sị na nzuko Nato abụrụla ihe nwụrụ anwụ kwuo na obi mba Amerịka adịchaghị na ya ọzọ. Ọ sị na mba Amerịka agwaghị otu Nato tupu o wepụ ndịagha ya site na mba Siria. N'egwuregwu N'asọmpi Uefa Europa taa, Manchester United ga-anwale ike ha mgbe ha ga-ezute Partizan Belgrade dịka ha gbachara ọnyụpa n'aka ndị Bournamount. Onye nchịkọta ha bụ Ole Gunnar Solskjaer sị na ha dị njikere maka asọmpi a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye? Gọọmentị enyela iwu ọzọ maka mmechi ọkeala Naijirịa Gọọmentị etiti enyela iwu ka akwụsị ibunye ọdọ mmanụ ụgbọala ọbụla nọ na ogige kilomita iri abụọ n'oke Naijiria mmanụ ụgbọala. Ọ bụ ndị ọrụ ngalaba 'Customs' ndị zipụru akwụkwo mgbasa ozi n'ụbọchị 6 nke Nọvemba maka atụmatụ a gwara BBC okwu maka ya. Ha s ị na iwu a kwuru na ndị niile ometụtara ga-erububere ya isi na egbughị oge. Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Cheta na nke a na-abịa dịka gọọmentị mechiri oke Naijirịa n'ọnwa Oktoba maka ndị na-ebubata ahia iwu na ahia adigboroja, ma kwa ndị na ebu mmanụ ụgbọala site Naijirịa gaa mba ndị ọzọ Afọ iri na anọ na nga chere onyekụzi mahadum metọrọ nwata akwụkwọ Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa akwadola ịmanye iwu ga-eme ka onye nkuzi Mahadum ọbụla metọrọ nwata akwụkwọ maọbụ nye ya nsogbu mmekọrịta ga-aga ụlọ mkpọrọ afọ iri na anọ. Echiche ha bụ na nke a bụ ụzọ a ga-esi wepu ya bụ nsogbu na Mahadum kpam kpam. Ọ bụ Ovie Omo-Agege bụ Osote Onyeisi n'ụlọ Omeiwu Ukwu hibere iwu a. Okwuru maka ebe ọ kwụ ugbua n'akara Twitter ya. Atụmatụ a na-abịa n'azụ akụkọ banyere ihe a BBC mere. SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya Ebe ọzọ na Legọs Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu agwaala ndị mmadụ kpọọ ya ""Maazị Gọvanọ"" dịka o wepụrụ 'His Excellency"" n'aha a na-etu ya. O kwuru na aha ọhụrụ ya ga-egosi ihe niile e kwesiri ịji mara ya bụ obi ume ala nakwa ijere ndị Legọs ozi. Na mba ofesi Ihe ruru mmadụ iri atọ na asaa anwụọla ebe mmadụ iri isii merụrụ ahụ mgbe a wakporo ụgbọala njem ise bu ndị ọrụ na mba Burkina Faso. E chere na ọ bụ ndị na-eyi ndụ egwu kpara ya bụ mkpa mkpa N'egwuregwu Ọ dịka enweela Neymar ọhụrụ na otu Real Madrid A na-etu Rodrygo Silva de Goes ""Neymar"" dịka o nyere ọkpụ goolu atọ n'ime ọkpụ goolu isii nke otu ya ji merie Galatasaray ụnyaahụ. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 43889959,https://www.bbc.com/igbo/43889959,"'Onyenkuzi kwadara m n'ule maka na ekweghị m""",Nwaakwụkwọ Obafemi Awolowo University nọ n'okwu ebubo onyenkuzi chọrọ ịdina nwakwụkwụ ya iji kwalite ya ka ọ gafee n'ule agwala kọmitii na-enyocha okwu ahụ na Prof. Richard Akindele ma ama kwada ya n'ihi na ya jụrụ ime ihe o kwuru.,"OAU bụ madadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Okaiwu na-ekwuchitere nwata nwaanyị ahụ bụ Abiola Akinyode-Afolabi, kwupụtara nke a gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuusde ka ha pụctachara n'ọgbakọ nke kọmịtị ahụ hiwere n' ụlọ akwụkwọ ahụ. Na nsonso a, nwaakwụkwọ ahụ zipụrụ akụkọ dị n'igwe e ji amịta okwu (recorded audio) na soshal midia nke gosipụtara olu Akindele ka ọ na-amanye nwakwụkwọ ahụ ka ya na ya dina iji gafee ule. Akinyode-Afolabi gwara ndị ntaakụkọ na nwakwụkwọ ahụ kọrọ ya n'uju ihe mere n'etiti ya na onyenkuzi ya, na ya enweghị pasent 33 kama na ọ bụ maka na ya ekweghị ịdina onyekụzị ahụ mere o jiri kwada ya. Ọ gara n'ihu kwupụta na ya kpesara ndị nkuzi ndị ọzọ mana o nweghị ihe ha mere. Akụkọ ga-amasị gị: Cheta na abalị ole na ole gara aga, mahadum OAU kwụsiri Akindele bụ onyenkuzi na ngalaba nlekọta na ọnụgụgụ nke a kpọrọ Management and Accounting Department na bekee, iji nye ohere ka e meecha nnyocha zuru oke banyere ebubo na ọ gwara nwaakwụkwọ ya dịna ya iji gafee ule. Kemgbe akụkọ ahụ na-efegharị, Akindele enyebeghị ọsịsa ọbula nnye ọha na eze. Umụakwụkwọ OAU na-ekwu na Akindele na-akpabu ụdí akwa mbụ" afirika-43085114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43085114,Ndi uwe ojii: Oke bụrụ ọgwụike a furuefu,"Ka ọ dị be oke, ka ọdị be ọgịnị. N'obodo Kwale nke mba Kenya, ndị uweojii atọ boro oke na ọ kpụrụ ọgwụike akpọrọ 'Bhang 540' nari ise na iri anọ nke e dokwara n'ogige ha maka iji mee ihe akaebe n'ụlọikpe.","Oke ọ ga-agọpụli onwe ya na ebubo a? Ndị uweojii atọ aha ha bụ Inspetọ Ken Olonde, onye bụ onye nchọpụta, AP Inspectọ Patrick Baya na Sagent Hamisi Komboaha bụ ndị akaebe n'ikpe ụmụnwaanyị anọ e jidere maka ibu ọgwụike ruru 1,710 site n'obodo Migori ga Ukunda nke dị na Kwale. Ndị uweojii a bụ ndị nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a. Mgbe ọ na agba ndị uweojii a ajụjụọnụ, onye ọkaiwu nọchitere otu na ndị eboro ebubo bụ Abdull Aminga jụrụ ndị uweojii ahụ ka ha kọwaa ihe mere na agba ọgwuike ahụ fọrọ sọọsọ 1,170. Gu kwa A kwụsịla onye JAMB boro agwọ ebubọ ọrụ n'ike Lekwa agwọ loro nde naira 36 Ndị uweojii ahụ kwuru na oke banyere n'oge ndị uweojii Kwale ebe e dotere agba ndị ahụ ma taa ha. Mana ihe gbakwojuru ndị biara n'ụlọikpe ahụ nke onye Okaikpe Paul Mutai nọ n'isi ya bụ na onweghị ogehre dị na igbe anọ ahụ ebe ọgwụike ahụ dị. Ọ bụ n'ọnwa Julai afọ garaaga ka ha nyụchiri Pauline Moraa, Elizabeth Atieno, Nancy Auma, na Mercy Achieng." afirika-45460717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45460717,Ụzọ ọjọọ dị n'ala Igbo,"N'ime inyocha ụzọ nke BBC Igbo mere, anyị chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụzọ n'ime ụzọ anọ gbara Owere gburugburu ndị anyị gara bụ nke gọọmenti etiti nwe ka dị mma.","Nke a bụ ụzọ si Owere gawa Onicha, mana a bịa n'ụzọ si Owere gawa Portharcourt, ihe ruru kilomita iri abụọ adịghị mma chacha bụ nke na-akpabeghi aka n'ime ọtụtụ afọ gara aga. Nke a mere ndị ọkwọụgbọala na-agba ụzọ ahụ ji ebe akwa, na-arịọ gọọmentị etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. N'ụzọ Ụlakwọ, nke si Owere gawa Aba, anyị hụrụ ngwaọrụ ndị na-arụ ụzọ mana o nweghị ndị mmadụ na-arụ ụzọ anyị hụrụ. Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na o ruela ọnwa isii ndị ọrụ a bidoro ikewa ụzọ ahụ abụọ. Nke si Owere gawa Umuahia ka nwere ọtụtụ ebe na-adịghị mma. Otu onye ọkwọụgbọala kwuru na ọ karịala ihe ruru afọ iri na isii a rụrụ ọrụ n'ụzọ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43834024,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43834024,E bugoola ndị uweojii 45 maka nwụchi Evans,"Ndị uweojii ebugoola ndị otu ha ruru iri anọ na ise ya na ndị ọzọ e mekwara ihe ọma maka mbọ ha gbara n'inwụchị onye a na-enyocha maka ntọ mmadụ akpọrọ Chukwudumuje Onuoamadike, a.k.a. Evans na ndị otu ya.","Chukwudumeme Onwụamadike a.k.a Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa Ndị uweojii a ebugoro gunyere ndị nọ ngalaba na-enweta amamihe gbasara ohi na mpụ ,ngalaba na-ahụ maka ihe eji nyocha mpụ na ohi nke nọ n'okpuru onyeisi uweojii na-ahu maka nyocha n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ndị uweojii sị na ha kpebiri ibugo ndị otu ha na nzukọ ha na onyeisi ha bụ Mike Okiro, onye bụbụ onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa. Ndị uweojii ka ha nọ na mputa ụlọikpe eche ka kpecha ikpe Evans mbge jidechara ya ọfụọ Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ bụ Ikechukwu Ani kwuru n'akwụkwọ o depụtara ""na mbugo a bụ maka ezigbo mbọ puru iche ndị uweojii ahu gbara n'inwuchi ndị ntọ yinyere ndị Naịjirịa ụjọ dị egwu. O kwuru na ọ bụkwa iji wee mee ka ihe mbọ onye uweojii ọ bụla gbara daba n'ọkwa a na-enye ya. O kwuru na dika Okiro sị kwuo na ọkwa ọhurụ a ga-akpalite mmuọ ndi uweojii a iji mee ọfụma ọzọ. kedu ndị e bugoro? Lee ndị nwetere mbugo: DCP Habu Sani-onyeisi ndi uweojii na-ahu maka nyocha,onye nke ga-aputa maka mpakọrịta ụka gbasara ndị uweojii na-aba n'ọkwa kọmishọna Ndị ọzọ bụ mmadụ abụo esi n'ọkwa enyemaka Kọmishọna uweojii bugo ha n'ọkwa osote Komishọna, otu onyeisi suparintendenti bara n'ọkwa enyemaka kọmishọna,otu suparintendenti bara n'ọkwa ọkachasị suparintendenti,ndị enyemaka suparintendenti ruru iri na isii(16) bara n'ọkwa osote suparintendenti na ndị nyocha enyemaka suparintendenti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 42962618,https://www.bbc.com/igbo/42962618,Naijiria: Anyi na Cameroun ga-akwụsị ndị agha oyi egwu,Onye ndụmọdụ pụrụiche nke onye isi ala Naijiria n'ihe gbasara nche obodo bụ Babagana Monguno ekwuola na Naijiria ga-enyere ala Cameroun aka ịkwụsị ihe iyi egwu gbasara idunotu nke ala ha.,"Onye isi ala Naijirịa ekwuola na ha emeriela ndị agha Boko Haram O kwuru nke a maka ndị ala Kameruun a chughachịrị azụ ga ala ha. Mongono kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị nọchịtere ala Kameruun mere n'Abuja. O kwukwara na Naijiria ga-enyere Kameruun aka maka ndị agha iyi egwu na-enye nsogbu n'ala ha. Mana ọ kọwaputaghị ihe kpatara ha ji chughachi ndi Cameroun ruru ịrị anọ sị ha lawa be ha. O kwuru na goomentị Naijirịa agaghị ekwe ka ndị agha iyi egwu jiri Naijiria mere ebe eji aluso ala cameroun ọgụ. Otu jikọtọrọ mba uwa niile ekwuola na obi adịghị ha nma maka ndi Cameroun gọọmentị Naijiria chughachiri azụ. Ugbua, onweghị onye ọbula nọ na ọchịchị gọọmentị Naijiria kwetara ị za ajụjụ n'aka BBC gbasara ndị Kameruun a achụghachịrị azụ." afirika-45716140,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45716140,Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Melania Trump abịala Afrịka,Melania Trump anwụọla n'Afrika,"Nwunye onyeisiala Amerika bụ Melania Trump ebidoola njem ya n'Afrika. Melania abataala Gana ebe ọ hụrụ ọtụtụ ụmụaka n'ụlọọgwụ. Ọ ga-esi Gana gawa mba Kenya, Malawi na Ijipit. APC amachiela ntuliaka imeụlọ nke APC n'Imo steeti Ha nwere mkpebia a dịka akwụkwọ pụtara na soshal midia nke Ahmed Gulak binyere aka na-egosi na Hope Uzodimma meriri ebe akwụkwọ onyeisi mgbasaozi pati APC n'Imo steeti bụ Onwuasoanya FCC Jones dere kwurui na ọ bụ Uche Nwosu meriri ya bụ ntuliaka. Gịnị ga-eme Ambode n'ihu? Gọvanọ Legọs steeti bụ Akinwunmu Ambode abịaghị ebe ha na-ebinye aka na ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs steeti taa. Cheta na akụkọ na-efegharị na-ekwu na nna ukwu patị APC bụ Bola Tinubu anaghị akwado Ambode maka esemokwu dị n'etiti ha abụọ. Ronaldo na ebubo nwakpo Ndị uweojii na Texas Amerịka ekwuola na ha ebidola ịleba anya n'ebubo otu nwaanyị boro Christiano Ronaldo n'afọ 2009 na-ekwu na Ronaldo wakporo ya. Ronaldo bu onye otu egwuregwu bọọlụ Juventus na-agọ ebubo a. Gee nkeji BBC Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya Chris Okotie ekwuputala uche ya gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị Ụkọchukwu ndị Household of God church bụ Chris Okotie ekwuputala na ya ga-esonye n'ịzọ ọkwa ọchịchị ala Naịjirịa n'afọ 2019. Cheta na Chris Okotie apụtala ịzọ ọkwa onyeisiala ụgboro abụọ n'oge gara aga. Ọzọ Emeka ihedioha abụrụla onye ga-anọchị anya otu pati PDP n'izọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti. Onye so ya n'azụ n'ọnụọgụgụ vootu a tụrụ bụ Samuel Anyanwu nakwa Ethan Achonu. N'okwu yiri ibe ya Akụkọ ọgụ na mgba bụ ihe so ntụliaka imeụlọ nke e mere na Krọs Rịva steeti ụnyaahụ pụta. A nụkwara na e mere ntụlịaka imeụlọ abụọ otu n'ime kwụnyere Matthew Achigbe ebe ndị ọzọ kwụnyere Etim John nke mere na e nwere mmadụ abụọ n'azọ nnọchị anya APC na Krọs Rịva steeti ugbua. Na mba ofesi Nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Melania Trump ga-atụ ọkpa na mba Ghana taa na njem mbụ ya ọ na-esoghi di ya. Ọ ga-aga kwa mba Malawi, Kenya nakwa Ijipit ịhụ maka ihe metụtara ụmụaka. N'egwuregwu, Onye ndu otu Eguregwu Super Eagles bụ Gernọt Rohr akpọpụtala aha mmadụ iri abụọ na atọ bụ ndị ga-agbara Naịjirịa mgbe ha ga-ezute mba Libya iji chọpụta onye tozuru ịbanye asọmpị Africa Cup of Nations. Alex Iwobi, Francis Uzoho nakwa Ikechukwu Ezenwa so na ndị Rohr kpọrọ aha. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-57232173,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57232173,Ebere Asonibe: Achọburu m ịbụ dọkịta maọbụ nọọsụ mana abụzị m dibia,I hụtụla nwagbọghọ na-esi ọgwụ?,"Ebere Asonibe bụ asamma kwuru na ọgwụ ọ na-esi bụ ọnatarachi . O kwuru na mgbe ọ malitere, nne na nna ya anatabaghị atụmatụ ahụ mana ugbua ndị mmadụ na-achọzi ya ka akara ọkụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo etu o sibu masị ya ịbụ dọkịta maọbụ nọọsụ oge ọ ka bụ nwata, mana ugbua ọ bụzị dibia na-esi ọgwụ. Ọ kọwara etu ihe ọbụla nwereike ịbụ ọgwụ; ma aja, mmiri wdgz. Gee olu ya n'uju." afirika-48002018,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48002018,Killiwee Nwachukwu: Etu dike a siri nwete aha ya,"Akụkọ maka Killiwee Nwachukwu karịrị. Ọ bụ aha eji eyi ụmụaka egwu, ma jikwere na-amaatụ onye siri ike.","BBC Igbo gara Mbaitoli dị n'Imo steeti ịga hụ onye a bụ Killiwee Nwachukwu ma mata ka ọ bụ mmadụ, ka ọ bụ mụọ. Kirie ihe agwara anyị ebe a. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chiagozie Nwonwu Akuko ga-amasi gị:" afirika-44221785,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44221785,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Jong-Un a ga-ezukọ?,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Rochas agaghị apụ APC Okorocha ga-aritu n'ọkwa gọvanọ Imo steeti na 2019 Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola na ọ gaghị eji maka onye ọbụla pụọ na pati ya bụ APC maka na o so na ndị bidoro ya na steeti ahụ. O kwuru nke a ka akụkọ na-agagharị na ya bụ Rochas chọrọ ịlaghachị otu APGA bụ ebe ọ nọbu. 'Naịjirịa nọ n'ọgbaghara' Poopu mere Archbishop John Onaiyekan kadịnal n'afọ 2012 Onye nchịkọta ndị ụka katọlik niile nọ n'Abuja bụ Archbishop John Onaiyekan, ekwuola na Naịjirịa nọ n'ọdụ ọgbaghara maka ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na mba a. O kwuru nkea ka ọ na-aka ụka akwamozu maka mmadụ iri na itoolu gụnyere ndị fada abụọ ndị a na-enyo bụ ndị ọchiehi gburu na Benue n'ọnwa Epreelụ. Nzukọ Trump na Jong-Un ọ ga-enwe isi? Trump na Jong-Un kwesịrị inwe nzukọ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Juun Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na nzukọ ya na onyeisiala Nọt Korea bụ Kim Jong-Un nwere ike ghara ịbịa na mmezu. O kwuru na e nwere ọnọdụ ndị ha chọrọ mana ọ bụrụ na ha enwetaghị ha, nzukọ ahụ agaghị eme. O kwukwara na omume Kim Jong-Un agbanweela kamgbe ha kwenyere inwe ọgbakọ a. N'egwuregwu Ndị bọọlụ na-amasị toro ndị Super eagles ike n'agbanyeghị na ndị otu Atletico Madrid ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi enyi na enyi a gbara n'Uyo ụnyaahụ. Gee ya na nkeji nke ututu a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Bobmanuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa" afirika-55185280,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55185280,"Ikenokwalu Godson: Ihe mere m ji eji ọnụ, ụkwụ, ntị n'akụkụ ahụ m ndị ọzọ ese ihe","Mmadụ iji aka ese ihe abụghị nnukwu ihe akụkọ, mana Ikenokwalu Godson ji akụkụ ahụ ya ọbụla ese ihe.","Ma aka, ụkwụ, isi, ọnụ, ntị, ọkụ maọbụ ihe ọ bụla, Godson jicha ha ese ihe. Ọ kọọrọ BBC Igbo etu o si malite nakwa ihe na-akpalite mmụọ ya. Gere ye n'uju n'onyonyo dị n'elu. Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" akuko-ndi-ozo-43006673,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-43006673,Buhari:Ndị ọkaiwu kwụsinụ mpu ma me ihe ziri ezi,"Ka otu n'ahụ maka ihe gbasara ndị ọkaiwu na otu ha sị akpa agwa akpọrọ National Judical council(NJC) wetechara ihe ha kpatara n'ọgbakọ ha,Buhari akwadola ila ezumike nka n'ike okaiwu ukwu akpọrọ Adeniyi Ademola nke ụlọikpe","Buhari kwere ndị Naijirịa nkwa na ọchịchị ya ga-ekpochafụ mpụ na nrụrụaka. ukwuu gọọmentị etiti (federal high court) di na Abuja ya na ichụ n'ọrụ okaiwu O.O Tokode nke ụlọikpe ukwuu dị na Benin. Akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere ụlọọchịchị Naijiria bụ Garba Shehu wepụtara kwuru na ya bụ nkpebi nwere nkwado n'akwụkwọ iwu nke Naijiria dika esi hazigharia ya. Ọkaiwu O.O. Tokode ga-akwụghachị ụgwọ ọnwa niile o nwetere n'ụzọ na-ezighi ezi site na ọnwa Disemba abụo n'afọ 2015 mgbe e duru ya n'iyi ọrụ dika ọkaiwu ukwuu nkje gọọmentị etiti rue ụgbụa. Shehu sịrị na Buhari na-ayọị ndị ọkaiwu ka mee ihe ha kwesịrị ime ma gbanahụ mpụ na nrụruaka ma ha na-arụ ọru ọrụ ha. N'ime akwụkwọ ozi ọzọ, Shehu siri na Buhari na-agba mbọ ihụ na onye ọbụla ndị NJC họpụtara maka iru na ụlọikpe dị iche iche ga-abụrịrị onye na-enweghị ntụpọ. Lotanu na ndi NJC kpebiri na nzukọ ha mere n'ọnwa Disemba isii n'afọ 2017 ezumike nka n'ike nke Ademola na Tokode maka nrụrụaka. Gụrụ ihe ndị mmadu na-ede n'igwe okwu twita:" afirika-52207043,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52207043,Covid-19 n'otu nkeji: 'Vitamin C' anaghị agwọ ọrịa coronavirus,"Maka ndị na-ekwu na coronavirus na-agwọ ọrịa coronavirus, nke ahụ bụ okpotokpo asị.","O nweghi nnyocha gosiri na 'vitamin C' na-agwọ ọrịa coronavirus. Ya bụ, onye mara asụ ya sụọ n'ikwe. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru, Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo" afirika-43676624,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43676624,Kanu Nwankwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m,"Nwafọ Igbo gbara Naịjirịa bọọlụ n'oge gara bụ Kanu Nwankwo, ekwuola na aka ya adịghị na akụkọ na-ekwu na ọ na-achọ izọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.","Kanu kwuru nke a taa na mgbape ihe emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs. Okelere ndị mmadụ maka nkwado ha ma kwuo na ọdịghị na njikere maka ndọrọndọrọ ọchịchị ugbu a. Emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs. ""Ka m were ohere a mee ka ndị mmadụ mara na m na-ekele ha maka nkwado ha nyere m. Mana aka Kanu adịghị na ya, Kanu anaghị adọ ọkwa ọchịchị onyeisiala. Mana, ihe kachasị mkpa bụ na aṅụtụla mmiri ahụ, ụbọchị ọbụla m dị njikere ị pụta, a gaghị m achọ ka mmadụ mere m ya, a ga m apụta n’onwe m."" Kanu kwuru. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44090258,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44090258,Onye ga-anọchị Arsene Wenger na Arsenal?,"Asọmpị dị iche iche n'egwuregwu bọọlụ na-akwakọ ọnụ ugbua, dịka ka anyị si mara, Arsene Wenger bụ onye nchịkọta Arsenal ekwuola na ya ga-eritu n'ọkwa ya dika onye nchịkọta otu ahụ.","Onye ga-anọchie anya Arsene Wenger Onye ọzọ kwuru na ya ga-apụ na ngwụcha afọ egwuregwu a bụ Unai Emery, bụbụ onye nchịkọta otu Paris Saint-Germain. Onye na onye were ike ịpụ n'ọrụ ha Ndị ọzọ anyị na-eche na ha ga-apụ n'ebe ha na-eme nchịkọta ugbua bụ ndị a: Massimiliano Allegri Massimiliano Allegri ọ ga-anọchị Wenger? Ọ bụ onye nchịkọta Juventus ugbua mana akụkọ dị iche iche na-ekwu na anya ya nọ n'ọkwa nchịkọta Arsenal. Luis Enrique Enrique bụ onye chịkọtara Barcelona n'oge garaaga. Akụkọ kwukwara na anya ya ka dị n'otu Arsenal. Jurgen Klopp Jurgen Klopp dị afọ iri ise Onye nchịkọta otu Liverpool bụ onye ọzọ a na-ele anya ma ọ ga-apụ gawa Arsenal maka ọrụ Arsene Wenger. Mikel Arteta Arteta bụ onye ọzọ a na-atụ aka ma ọ ga-abụ onye ga-anọchị anya Wenger n'Arsenal. Ndị ọzọ anyị na-ele anya ma ha a ga-apụ ebe ha nọ ugbua bụ ndị nchịkọta otu dịka Stoke City na Westbrom. Nkea bụ maka ha abụọ apụọla n'ime ndị na-agba asọmpị Premier League ugbua." afirika-44791719,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44791719,Imo Steeti: Ọ fọrọ ọnwa atọ ka achabie ikpe Madumere,Ndị ụlọomeiwu Imo steeti mere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ma kpebie na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma ọ ga-apụ n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ.,"N'ajụjụ BBC Igbo gbara onyeisi ndu ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti bụ Lugard Osuji n'ekwentị. O kwuru na ọ bụ akwụkwọ mkpesa ka edere n'isi Madumere nke gụnyere ịgbanarị ọrụ ya, agaghị nzukọ nakwa ịtụ asị na ọ gaghị ụlọ mkpọrọ tupu eduo ya n'iyi ọrụ. Osuji kwuru na ha chọpụtara na Madumere dara iwu mana okwu gbasara ịchutu ya dị n'aka ọkaikpe nke Imo steeti. Ọ gara n'ihu kwuo na ọkaikpe ga-eme nyocha banyere nke a n'ime ọnwa atọ ma kpebie ma a ga-achutu Madumere ma ọ bụ agaghị achutu ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43287445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43287445,Okwu Tony Ezimakor: Gọọmentị ana-akpachị mgbasa ọzi?,"Ngalaba nzuzo na-ahụ maka nchekwa nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ nwụchiri onyeisi ọrụ ụlọ ntaakụkọ Daily Independent na mpaghara Abuja bụ Tony Ezimakor ụbọchị Wenesde, ọnwa Febrụwarị 28, nke afọ n'ihi na ụlọakụkọ ha dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru iji napụta ụfọdụ ụmụaka Chibok n'aka ndị Boko Haram.","DSS nwụchiri Tony Ezimakor n'ihi na ụlọ akụkọ nke oso n'isi ya dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru maka ụmụaka Chibok Ka ọnwa Febrụwarị dị iri abuo na abụọ, Daily Independent dere akụkọ nke kọwapụtara otu mba Switzerland siri nyere gọọmentị etiti aka iji ego ruru nde kwuru nde dọla gọpụta isi ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram tọpụrụ, na etu ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti si jiri ohere ahụ ya fọjuo akpa ha. Na nkọwa ya n'ụnyahụ bụ Monde, onyeisi ọrụ na-ahụ maka ibipụta akụkọ na Daily Independent bụ Don Kere gwara BBC n'ekwenti na Ezimakor ka nọ n'ogige ndị DSS. Kere - onye kwuru na ọ bụ ya ka ndị DSS gara anwụchi, ma mgbe ha enwetaghị ya, ha ziri ozi ka onye nnọchite anya ha n'Abuja bịa n'ụlọọrụ ha - kọwara na ọ bụ akụkọ ụlọ ntaakụkọ ha dere banyere ego gọọmenti etiti nyere ndị Boko Haram iji gbapụta ụfọdụ ụmụaka Chibok bụ ihe mere DSS jiri nwuchie onye ọrụ ha. Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na gọọmenti etiti na-akpachị mgbasa ozi n'ikike ndị mmadụ nwere imata ihe na-eme n'obodo. ""Ọ dịzị ka anyị anọ n'ọchịchị ndịagha maka ha achọghị ka ndị mmadụ mata ihe na-eme n'obodo. Onye kwuo, ha ejide ya."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọtụtụ otu ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye akpọla oku ka DSS hapụ nwaamadị ahụ na-enyeghị ọnọdụ ọbụla. Otu onye na-ahụ maka ikike dịrị ndị ntaakụkọ bụ Lanre Arogundade, kwuru na ị nwụchi ma jichie Ezimakor bụ ikpachi mgbasa ozi na ikike onye kwuo uche ya. Arogundade bụkwa onyeisi International Press Centre, Lagos, gara n'ihu sị,"" Anyị na-agwa DSS ka ha tọghapụ nwa amadị ahụ na-enyeghị ọnọdụ ọbụla maọbụ ha kpụpụ ya ụlọikpe."" Mbọ anyị gbara iji nweta ebunuche onye isi ndị ntakụka n'ala anyị bụ Waheed Odusile amịtaghị mkpụrụ. Mgbe onye ntaakụkọ anyị kpọrọ ya, ọ kwuru na ya ji ihe dị oke mkpa n'aka. Na nsonso inwụchi na isogbu nke ndị ntaakụkọ bulitere mkparita ụka na ọchịhị Muhammdu Buhari na-emegide ikike onye kwuo uche ya na Najiria n'ihi ọtụ ndị mmadụ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị a nwụchiri n'oge a. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na Twitter: Ndị ntaakụkọ anwụchiri n'oge Buhari gunyeree: 1. Ndị otu ndị uweojii a kpọrọ SARS nwụchiri Daniel Elombah, onye nwe, 'Elombah.com,' n' ọnwa Janụwarị 1, afọ 2018 maka ide ihe katọrọ Buhari 2. Ndị uweojii nwụchịri Jacob Onjewu Dickson n'afo 2016 maka ide na ndị ntorobịa tụrụ Gọvanọ Kaduna State, Nasir Elrufai, okwute 3. Ndị uweojii nọ n'Abuja wakporo Muhammad Atta-Kafin-Dangi, onye ntaakụkọ radio Nigeria maka ịgba ka ọ gbasa ozi banyere ngarịiwe nke ndị na-agba ọkada mere 4. Ụbochi iri abụọ na ise nke ọnwa Juun afọ 2016, ndị ọrụ Custom kụrụ onye ntaakụkọ,Yomi Olomofe Muhammad isianbaokpu na ogige ha dị n'a Lagos 5. Na ọnwa Ogostụ 2016, EFCC nwuchiri onye ntaakụkọ websait bụ Abubakar Sidiq Usman na Abuja Chetakwa na nsonso, ozi pụtaranụ kwuru na ụlọomeiwụ nke ukwu bụ Sineti na-akpa nkata ime iwu ka a kwugbuo onye ọbụla a mara ikpe ikwu okwu asị nke a kpọrọ 'hate speech' na bekee." afirika-44821758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44821758,Aghọgburu nwa m wee mịa ya ọbara - Oriaku Adesanya,"Ọriakụ Nene Adesanya kọwara BBC Igbo etu Paul Achegbulu jiri ghọrịgbuo nwa ya nwoke ma mịrị ""pint"" ọbara anọ n'ahụ ya.","Nne kwuru na nwa ya nwoke dị afọ iri na asaa bụ onye lechara ule WAEC nke afọ a ka otu nwoke hụrụ n'ebe ọ na-ekiri bọọlụ kpọrọ ya gaa n'ụlọ Paul Achegbulu bụ onye mịrị ya ọbara. O kwuru na ọ mịrị nwa ya ""pent"" ọbara anọ n'ime otu ọnwa nke mere nwa ya jiri daa dịka o si n'ụlọ Achegbulu na-apụta. Nene kwuru na ọ bụ ndị enyi nwa ya kpọrọ ya gawa n'ụlọọgwụ tupu ọ na-ata ozi ihe na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42856096,https://www.bbc.com/igbo/42856096,Oche goolu bụ onye etulu ugo ka Naịjirịa mmeriri Angola,Onyeisi ndị ndị Super Eagles nke ụlọ bụ Ikechukwu Ezenwa bụ onye a tụrụ ugo ka onye kachasị gba bọọlu na mmeri Naijirịa meriri mba Anghola na asọmpị CHAN ụnyahụ.,"Ezenwa nwere ike iga Russia Ezenwa bụ onye nke atọ na ndị egwuregwu Naijirịa enyere otu ugo kamgbe ebidoro CHAN nke afọ a. Ezenwa na echere ndị Enyimba goolu. Na sọmpị a, ọ chetara goolu nke oma, ma nwuchie bọọlụ na na akwadọ iba goolu ụgboro anọ. Ana atu anya na otu Ezenwa siri sọmpị na CHAN ga eme ka o soro ga isọmpị na Russia na afọ na-abịa. Angola bụrụ ụzọ nye goolu, mana Naijiria sara ya ma nyekwa ọzọ. Anthony Okpotu na Gabriel Okechukwu bụ ndị nyere goolu ndị a. Naijiria na Sudan ga sọmpị na Marrakech na Wenesde." 48319455,https://www.bbc.com/igbo/48319455,Uche Ogbodo: Ahụla m nkeọma na nke ọjọọ,Ụbọchị ncheta ọmụmụ mmadụ na-abụkarị ọpụrụiche mana amaghị m ihe ndị mmadụ ji kpụrụzie nke onye na-eme ihe nkiri bụ Uche Ogbodo n'ọnụ.,"N'iji ịcheta ụbọchị ọmụmụ ya, Ogbodo were foto o sere ebe ọ gba ọtọ tinye n'elu soshal midia. End of Instagram post, 1 O jikwa ohere a depụta ihe niile ọ gabigagoro ma ja onwe ya ike na ọ bụ nwaanyị siri ajọ ike. Ndị mmadụ agbaghị ya nkịtị maọlị. Lekwa ihe ha depụatara. @Areafada1 jụrụ ihe ndị mmadụ ji etụfụ ụra maka ọtọ Uche, ọ bụ na ha amaghị na ọ bụ onye na-eme ihe nkiri? @EsterOnyinye okwuru na aọ bụghị ihe mghbagọjụ anya makana o teela ọtụwara anya agwa a n'aka Uche. @dharmeelollar kwuru na ọ bụ ọrụ ise foto ka ọ ga na-arụzị. Cheta na Ogbodo rịọrọ ka iwu Naịjirịa kwado ịgba akwụna n'oge gara aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53977167,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53977167,Ọgba mbọ: 'Eji m ite uhie n'ụlọ na isacha ụgbọala mere aka ọrụ',Amarachi Okafo bụ nwaada malitere ite uhie n'ụlọ kemgbe ọ nọ afọ abụọ na Mahadum.,"Ka ọ gụchara akwụkwọ, ọ mepere ụlọọrụ ma wee ndị mmadụ na ya bụ ọrụ. Ọ mepekwara ebe ana asa ụgbọala bụ nke na nye ya ego gbanyụụ. Ọ bụ naanị ụmụnwaanyị bụ ndị na-arụ n'ụlọ ọrụ ya ndị dị na Anambra steeti. Kirie ka ha si ete uri n'ụlọ." 42891108,https://www.bbc.com/igbo/42891108,A malitela otu njikọ nke Obasanjo dere maka ya,"Amalitela otu njikọ Coalition For Nigeria nke Olusegun Obasanjo tụrụ aro ya n'akwụkwọ ozi odegaara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'ụbọchị iri na abụọ na atọ nke Jenụwarị, taa.","Obasanjo degaara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi toro ogologo iji sị ya azọla ọchịchị ọzọ n'afọ 2019 Obasanjo tụrụ aro a abịaghị mmemme a emere na Yar'Adua Centre dị n'Abuja, Olagunsoye Oyinlola na Donald Duke nọ na otu PDP oge ha bụ gọvanọ, so na ndị bịara. N'ime akwụkwọ ozi ahụ Obasanjo chịbụrụ Naịjirịa degaara Buhari, o kwuru sị na ndị otu APC na PDP enweghi ikike iji edozi Naịjirịa n'ọnọdụ ọ kwesịrị ịnọ, maka na ndị mmadụ enwezighi ntụkwasị obi n'ebe ha nọ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu Content is not available End of Twitter post, 1 Content is not available End of Twitter post, 2 Content is not available End of Twitter post, 3 Cheta na n'ime akwụkwọ ozi ahụ Obasanjo dere, ọ gwara Buhari na ya chefuo maka ịzọ ọkwa ọchịchị ọzọ ma oge ya gwụ na 2019." afirika-46768840,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46768840,Ndụmọdụ pụrụiche Charly Boy nyere ndị na-abanye alụmdinanwunye,Charly Boy na nwunye ya bụ Lady Di mere emume mmekwata ọlụlụ ha n'ọnwa Decemba 2018.,"BBC Igbo gara ka ọ gwa anyị etu ha si nọrọ na ya bụ njem ruo afọ iri anọ a ha rugoro. Charly Boy, bụkwa onye eji Charles Oputa mara, gwara BBC Igbo na ihe kachasị mkpa bụ ka di na nwunye bụrụ ọyị. Gee ya ntị ka ịnụta ndụmọdụ ndị ọzọ onyere Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45598594,https://www.bbc.com/igbo/45598594,Inec chọrọ enyemaka EFCC na ntuliaka,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Inec na EFCC,"Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC arịọla EFCC ka ha soro lebanye anya n'akụnaụba ndị pati Naịjirịa na ndị otu ha na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji achụnta vootu. Idemmiri Anambara Ka idemmiri na-enye ụfọdụ ndị bi n'Anambara nsogbu, kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ James Eze, kwuru na ya bụ idemmiri tara isi otu ụkọchukwu Katolik ka ọ na-achọ ịzọpụta enyi ya nwoke. O kwuru na ihe a bụ ihe ịgba anyammiri nke ha na-agba mbọ igbochi ma na-arịọkwa ka Chukwu nyere ha aka. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri Anambra ataala isi otu ụkọchukwu Na mba ofesi, Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri kpuru na Tanzania arịgoola narị na iri atọ na isii. Ndị ọrụ enyemaka na-enyere aka ịkpọpụta ndị ihe metụtara Cheta na ụbọchị 20 nke ọnwa Septemba 2018 ka e bidoro na-achọ ihe karịrị mmadụ narị ka ụgbọmmiri ahụ bu ihe ruru mmadụ narị anọ kpuru n'elu osimiri Victoria. N'egwuregwu, Onye egwu Man City bụ Sergio Aguero, ekwuola na obi dị ya ụtọ ịgbatịkwu afọ ole ọ ga-anọ n'otu egwuregwu ahụ. Nke a na-abịa dịka o tinyere aka n'akwụkwọ dọtịrị oge ya n'otu a ruo afọ 2021. Naịjirịa Onyeisiala Muhammadu Buhari emekwala Rotimi Amaechi bụ mịnịsịta okwu njem dịka onyeisi otu na-achụrụ ya nta vootu na ntuliaka 2019. Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Amaechi bụkwa onyeisi mgbasaozi otu ahụ n'oge ntuliaka 2015 nke ha meriri were bata n'ọchịchị. Ọzọ, Ụlọọrụ na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'aha ịchafụ achụọla ụfọdụ ndị ọrụ ha na-achọ ịraba ụmụnwaanyị ndị ha napụtara ka ha na ha nwee mmekọ anụ ahụ. Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa Ha kwuru na ha chụrụ mmadụ isii ebe ha nyekwara otu onye ọzọ ezumike nka n'ike maka izupu akụkọ gbasara ụlọọrụ ahụ resaa ndị mmadụ. Akụkọ mba ofesi Amerịka enyela ndị agha China ntaramahụhụ maka na ha gotere ụgbọelu e ji alụ agha n'aka ndị Rọshịa. Amerịka kwuru na azụmahịa ahụ mejọrọ mmachi ha machiri Rọshịa maka ihe Rọshịa mere na Ukren nakwa itinye aka na ntuliaka Amerịka. N'egwuregwu, Onye nkuzi ndị Arsenal bụ Unai Emery na-achị dịka eze n'asọmpi Europa League ebe Arsenal o kpotere goolu ka akwa. Pierre-Emerick Aubameyang has now scored 21 goals in his last 25 games in European competition Arsenal gbara otu FC Vorskla Poltava ọgbụ goolu anọ a satara abụọ ụnyaahụ n'asọmpi ahụ nyere Emery mmeri nke iri atọ na abụọ n'asọmpi Europa kamgbe ọrụ ya malitere. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." afirika-57252263,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57252263,Children's Day: A malitere m ọrụ DJ mgbe m dị afọ ise - DJ Irish,Nwata a dị afọ isii bụ Eze Chikamso e ji DJ Irish maara kọwaara BBC Igbo etu o si malite ọrụ ịkwakọta egwu a na-akpọ Disc Jockey.,"Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ọrụ a mgbe ọ dị afọ ise, mgbe nna ya zụtara udu egwu nwere ihe ndị DJ. DJ Irish sị na ọ gwara nna ya ka ọ zụtara ya ihe DJ ma kpọtara ya onye nkuzi ga-enyere ya aka. Nna ya mere nke a ma nyekwa ya nkwado ịmalite nkwọkọta egwu. Nne Irish bụ Adaobi Eze sị na ọrụ ya dịka DJ anaghị emetụta agụmaakwụkwọ ya, na ọ bụ ya mere o ji akwado ya. Kirie ihe ha kwuru n'uju; Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo" afirika-50094913,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50094913,Mouth Odour: Uche ndị ntorobịa gbasara ọnụ isi,Igbo na-atụ ilu na-asị na onye nọ mmadụ nso na-anụ isi eze ya.,Mana kedụkwanụ ka ị nwere ike isi gwa enyi gi na ọnụ ya na-esi isi ka ọ ghara ịdị ka ị na-akparị ya akparị? Lee ihe ndị ntorobịa anyị na ha nwere mkparịtaụka gwara anyị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: afirika-43552789,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43552789,Ụlọikpe sị Abaribe kpọpụta Nnamdi Kanu,Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya enyela iwu ka Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ kpọpụta Nnamdị Kanu n'ụlọikpe mgbe a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa June ma ọ bụ ha aga mkpọrọ.,"Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji. Abaribe, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ El-shalom na otu onye bi na Abuja bụ Tochukwu Uchendu gbaara Nnamdi Kanu akaebe e jiri tọpụ ya n'ụlọmkpọrọ. Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegidee ọchịchị ala Naijiria bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Septemba, afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ha oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ahụ. Ka ebulitere ikpe ahụ, ọka iwu na ekpechitere ndị ahụ bụ Chukwuma Machukwu Umeh, kwuru na enyebeghị ha akwụkwọ ụlọikpe nke kwupụtara iw ọkụ ahụ onye ọkaikpe nyere. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Gere akụkọ mere ụnyaahụ n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Na Facebook Live, anyị kpara maka ịdamba ntuliaka ji ndị Igbo nke bekee kpọrọ voter's apathy." afirika-43710697,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43710697,"Ndị Fulani na-achi ehi egbuola mmadụ 2,000 n'afọ a","Otu na-ahụ maka ikike ruru onye bụ nke akpọrọ ""Coalition on Conflict Resolution and Human Rights in Nigeria"" kwuru mmadụ ruru puku abụọ anwụọla ka puku na puku ọzọ agbala ọso ndụ maka nsogbu ndị n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọkọ ugbo.","Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Ndị a kwuru ihe a n'akwụkwo nyocha ha depụtara ụbọchị Monde. Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Chris Ewokor sị kọwa, otu a kwuru na ha nwetara ọnụ ọgụgụ a site na ịgụkọ mmadụ egburu, ụlọ na ihe ndị ọzọ emebiri na ihe so ya ọgụ dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo banyere ala na mmiri. Otu ahụ kwuru na ọgbaghara ndị a metụtara steeti ndị dị na etiti ugwu Naijiria dịka Benue, Taraba, Plateau, Kogi na Nasarawa; nke mere ka ndị ọchịchị wezuga iwu Naijiria n'ụsọ iji gba mbọ nchekwa na mpaghara ndị ahụ. Akwụkwọ nyocha ahụ gosikwara na e wezuga ọgbaghara dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo, ndị ohi kwanyere ahụ na nsogbu nchekwa e nwere were na-egbu mmadụ ma na-ezu ohi n'ọtụtụ ime obodo. Ka ọ dị ugbua, e zigala ndịagha na mpaghara ndị nwere nsogbu a metụtara, ebe ha nwụchigara ụfọdụ. Mana mwakpo ka na-aga n'ihu n'ọtụtụ ime obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51612600,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51612600,Heat in Nigeria: Etu ị ga-esi gbanahụ ọrịa ndị a okpomọkụ na-ebute,"Oke okpomọkụ nwereike ibutere gị ọtụtụ ọrịa, ya ka o ji dị mma ka ịmata ọrịa ndị a ma chekwa onwe gị nkeọma.",Kamgbe izuụka a ka ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na okpomọku na-eme ha ịwa mana lee ọrịa dị iche iche ya bụ ọnọdụ nwereike ibunye gị. Ọrịa okpomọkụ na-ebute gụnyere ndị a dọkịnta Chidi Akaghara kpọpụtara Fertility in women: 'A na-akpọ m osisi amịghị mkpụrụ'- Nwaanyị chọgoro nwa ọtụtụ afo Kedụ ka ị ga-esi chekwa onwe gị ugbua ebe niile na-apụ ọkụ? Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-43819567,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43819567,"Kaduna steeti achụọla ndịnkuzi 4,562 ọzọ n'ọrụ","Gọọmentị Kadụna steeti chụrụ ndịnkuzi 4,562 n'ime 15,897 ha were n'ọrụ na steeti ahụ na nsonso a n'ihi na ha amaghị ede akwụkwọ ozi.","Gọvanọ na-achị Kaduna steeti chụburu ndị nkuzi 22,000 maka amaghị ede Dịka onye enyemaka pụrụiche nke Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Alhaji Lawal Danjuma kwuru, ndị a achụrụ bụ ndị adigboroja amaghị onye tinyere aha ha n'akwụkwọ. ""Onye nkuzi ọbụla edenwughị akwụkwọ ozi ji kwuo na ya nabatara ọrụ enyere ya abụghị onyenkuzi. Anyị agaghị akpọrọ ụmụaka anyị nye ha ka ha kuziere ha."" Danjuma kwara BBC na gọọmenti ga-ewe ndị nkuzi 13,665 n'oge na-adịghị anya. N'afọ gara aga, Kaduna steeti chụrụ ndịnkuzi praịmarị dị 22,000 n'ọrụ maka ịda obere ule enyere ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49863028,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49863028,Allen Onyema: Ihe asatọ o kwuru Igbo ga-ejide aka iji gaa n’ihu,Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ihe ọ ga-abụ Igbo mee agamnihu abụrụ ihe na-achị na ndụ ha.,"Allen Onyema bụ oke nwa afọ Igbo tinyere ọnụ na ya bụ okwu were kpọpụta ihe asatọ ọ sị Igbo ga-eme. Okwu ya pụtara na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere na Legọs. Ọtụtụ okwu anaghị adị n’ụka mgbede, lee ihe nkiri a ma mata ihe o kwuru. Akukọ ga-amasi gị" afirika-44837405,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44837405,EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya,Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mmerụaka ego na Naịjirịa akpọrọ EFCC edeputala nke na-akpa ha ebe aka na-achị Ekiti steeti na-apụ apụ nọ.,"Ngige enyi m, imeela! Ha depụtara n' akara Twitter ha sị ""Mmemme ebiela, akwa mgbochi ekewaala. Akwụkwọ ikpe mmerụaka gbasara ụlọọrụ ebe a na-azụ anụmanụ n'Ekiti ebe e mefuru naịra nde 1.3 ga-emepe. Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya."" End of Twitter post, 1 Lee ihe ndị mmadụ sara ha na Twitter @odineisipatrick kwuru na EFCC egosighị na ha ma ọrụ ha site n'ihe ha depụtara na Twitter. @KadariaAhmed kwuru na EFCC ekwesighị ịdepụta ya etu a ma ọ bụrụ na Fayose mere mpụ. @El-bethel316 kwuru na ọ bụ ihe dị mma ma ọ bụrụ na a ga-eme ya ndị ọzọ nwekwara mgbochi onye nọ n'ọkwa ọchịchị. Anyi ga-ewetara unu akụkọ a dịka o si aga ." afirika-45117284,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45117284,N'Anambra onye uweojii agbagbuola ojiegoachụego,"Akụkọ kwuru na otu onye uweojii ya na ndị otu ya na-ana aka azụ gbagburu ojiegoachụego aha ya bụ Chinonso Onyeme n'Awka, Anambra steeti.","Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu n'ime ndịuweojii nọchịrị ụzọ ma naana ndị kwọ ụgbọala aka azụ, gbanyere egbe n'ụgbọala Toyota Sienna onye nwụrụ anwụ nọ n'ime ya, nke mere ka enyi ya sonyere ya gbapụta na-eti mkpu na a agbaala ogbo ya egbe."" Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra steeti bụ Harụna Mohammed gwara BBC na ndị uweojii ""ga-enyọcha ebubo amaghị eme nke onye otu ha ọbụla."" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50873631,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873631,Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche maka ndị na-asọ anụ?,Nnenna Ubani bụ osite Igbo anaghị eri anụ maọbụ azụ.,Ọ na-eme ụgba n'ụzọ pụrụiche n'etinyeghị anụ maọbụ azụ maka ịdozi ime ahụ mmadụ. BBC Igbo gara n'ụsekwu ya ebe ọ gosiri anyị etu o si agwọ ya. Lee ihe anya anyị hụrụ ebe a. 42843441,https://www.bbc.com/igbo/42843441,"""O nweghi ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ""- Ụlọ ikpe",Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akagbuola akwụkwọ ndị ezi na ụlọ Nnamdị Kanụ na ọkaiwu ya gbara ịjị rịọ ka ọ manye onye isi agha ala Najiria bụ Tukur Buratai ka kpọpụta Kanu ebe ha dowere ya.,"Kanu na ndị otu IPOB chọrọ ka Naijiria nye ha Biafra Jọstis Binta Nyako, bụ ọka-ikpe biri ikpe ahụ kwuru na o weghị anya etu ọnye a sị na a na-achọ achọ siri bụrụ onye gbara akwụkwọ ahụ n'ụlọ ikpe . Ọ gara na ihu kwuo na ha gara agba akwụkwọ ahụ n' aha Kanụ, kama ị sị na ọ bụ Kanụ tinyere ya. Kanụ, bụ onye ndu ndị otu Indigenous People of Biafra bụ IPOB n'aha ịchafụ bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Setemba afọ gara aga ka ndị agha gbasịrị ekwu eke na ọdịda anyanwụ ala Najiria. Ebe ndị otu IPOB na ebo gọọmenti etiti na ndị agha ebubo na ọ bụ ha ji Kanu. Cheta na onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful gwara BBC mgbe ọ na aza ajụjụ ọnụ na ọ bụ gọọment ji ya. Ọ kwuru : ""Kedụ ka ha ga-esi kweta na ha ji ya, ha mara na nwoke ahụ bụ nsogbu dịrị Naịjirịa, ha chọrọ ikpuchi ya ọnụ""." afirika-57244898,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57244898,Biafra Remembrance and Sit-at-home: Ihe 11 na-adịghị mma agha na-ebute,"Ọ bụ eziokwu na Igbo tụrụ ilu sị na agaghị eji maka mgbagbu aghara ọgụ, mana ọ dị mkpa mmadụ ịma ihe ọrụ nyere tupu o tinye isi n'ihe ọ na-achọ ịza oku ya.","Dịka ụfọdụ ndị na-akpọ oku ka e kewaa Naịjiria ka onye ọbụla (ma ndị chọrọ Biafra ma ndị chọrọ Ala Yoruba) nwere onwe ha site n'ịlụ agha ma ọ bụrụ ma o ruo etu ahụ, akụkọ a ga-akọwa ihe ndị nwereike ime ma agha su. Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi Lee ihe iri na otu agha nwereike ibute: 1) Agụụ na Ụbịam Foto na-egosi etu ndị mmadụ si kwụrụ n'ahịrị ịnata nri ha ga-eri oge agha Biafra Ị jụọ ndị hụrụ agha Biafra n'afọ 1967 ruo 1970 ihe so gbuo ihe ruru mmadụ nde atọ nwụrụ n'agha ahụ, otu ihe ha ga-agwa gị bụ ""agụụ"". Ruo echi, nke a so n'otu ihe ndị hụrụ agha ji etu mkpu na-etisi ya ike sị ""Ọzọemena"" n'ihi na ndị mmadụ takwutere ya kọnkịrị oge ahụ. N'ihi ahụghị ezigbo nri rie, ndị mmadụ bịara na-arịa ọrịa kwashịọkọ nke bụ ọrịa erighi nri na-edozi ahụ na-ebute. Ịma atụ: Onye na-arịa ọrịa shuga na ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ nwere ihe ndị o na-ekwesịghị iri, ugbua onye ahụ ga-erinwu ihe ndị ahụ, mana agha su, ọ bụzị naanị ihe onye hụrụ ka ọ ga-eri. 2) Ọnọdụ ahụike ọjọọ Ndị ọrịa na-anata ọgwụgwọ n'oge agha Biafra Onye na-eze mgbọ ọ ga na-achọ etu o si eru ụlọọgwụ? Ndị ụlọọrụ Centre for Memories wepụtachara foto gosiri etu ndị ọcha si na-enye ndị mmadụ ọgwụ na ihe ahụike ndị ọzọ oge agha Biafra, mana onye ka ị ga-enye ghara ole? Ogbunigwe dakwaanụ n'ụlọọgwụ ebe ị chọrọ ịgbaga? Ọ bụ eziokwu na ndị gbatagbata dịka ""Red Cross"" na ndị ọzọ nwereike ịgbata ọsọ enyemaka, mana ọ bụghị onye ọbụla ka ọ ga-eru aka. O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme 3) Amaghị onye bụ onye Foto ụfọdụ ndịagha Biafra Nke a bụ ọnọdụ Bekee na-akpọ 'enemies within and without'. Ndị agha na-ejikarị usoro a alụ agha, ọnọdụ ebe mmadụ ga-eme ka ọ kwụnyeere gị mana jiri ohere ahụ ghọgbuo gị ma memilaa gị. Agha su ugbua, ị ga-ama onye bụ onye? Ọ ga-abụ ọnọdụ onye ọbụla ịtụ ibe ya aka ebubo. 4) Mkpachi ngagharị Ebe ndị Igbo gbakọrọ n'Awgu, Enugu steeti n'oge agha Biafra n'afọ 1968 Ọ bụ ikike dịrị mmadụ ịgagharị etu na mgbe masịrị ya, mana otu ihe ọzọ agha na-ebute bụ mkpachi ngagharị. Ewezuga ize mgbọ, ogbunigwe na ngwaagha ndị ọzọ, agha anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ etu masịrị ya n'ihi na ""ala adịghị level"". Ma ị nwere akwụkwọ ikike ime njem, ma ị nwere ego, ihe ndị a agaghị azọpụta gị ma agha daa. 5) Ndakpọ Akụnaụba Oge agha, ọ bụrụ na mmadụ kpọsagodu ngwaahịa, onye ji ego o ji azụ? Ịlụ agha na-eri ego ma na-etipiakwa akụnaụba. Ndị hụrụ agha Biafra na-akọ maka etu e si nakọrọchaa ndị Igbo akụnaụba ha kpatara tupu agha ebido, ma nye ha naanị paụnd 20 iji bidokwa ụwa n'isi mgbe agha biri. Nke a so mee ka ndị hụrụ agha buru aka n'isi ruo ugbua na-eti mkpu na ịlụ agha egbe na mma ọzọ abụghị etu ka mma is azọta nnwereonwe. 6) Ọnwụ ndị ị hụrụ n'anya: Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra' Agha su ugbua, ọ bụ mmadụ niile ga-agbanwu ọsọ ndụ? Ụfọdụ ndị ga-agbalahụnwu ọnwụ, mana nke bụ eziokwu bụ na mgbọ nwereike ịtụ ndị aka ha dị ọcha na-esoghi kpọọ oku agha. Enwere onye ọ ga-amasị ịhụ ọnwụ onye ọ hụrụ n'anya n'ụzọ dị otu a? 7) Idina ụmụnwaanyị na ụmụaka n'ike Etu ụmụnwaanyị Biafra si husie anya n'oge agha Nke a so n'otu ọkpụrụkpụ ihe agha na-ebute. Ọ na-abụkarị ndị a na-alụso agha na-eme nke a iji gosi ndị ha na-alụso agha nkarị. Ebe ụfọdụ na-ezoro ezo awakpo ụmụnwaanyị na ụmụaka, ndị ọzọ na-eme ya n'ihu di, deede, maọbụ dimkpa ezinaụlọ iji sị ha ""ngwa awakpoola m nwa, nwunye, nwanne gị nwaanyị n'ihu gị ngwa gịnị ka ị ga-emeli?"" N'afọ 2014, ngalaba United Nations mere ọgbakọ ebe ha kpara nkata maka ndịagha ịkwụsị iji idina ụmụnwaanyị n'ike emere ngwaagha, mana otu ihe bụ ikwu okwu ihe ọzọ bụ ime ihe e kwuru. 8) Iwu agaghị enwezikwa ire (Breakdown of Law and Order) Obodo ọbụla nwere iwu na-echekwa ya nke a na-atụ anya na ndị bi ebe ahụ ga na-erubere isi. Tupu agha ebido, ụfọdụ ndị abụrụla ndị nnupuisi na-anaghị edobe iwu, mana agha bido ọ na-ala kpam kpam. Ka ọ dị ugbua, elu na ala na-enwuru ọkụ kemgbe izu ole ma ole dịka a na-anụ akụkọ ndị 'unknown gunmen', 'bandits', 'killer herdsmen' bụ ndị na-ejizi aka ha etinye iwu dịka igbu ndị mmadụ aghara aghara nakwa iwakpo ndị nchekwa maọbụ ndị ọbụla ha na-ahụta ka ọgbatuhie. Ụdịrị ihe a na-eme ka iwu ghara ịdị ire n'ihi na otu ọbụla ga-abụzị onyeisi nke onwe ya, nke a nwereike ime ka ndị agha chọọ iji ohere ahụ tinye onwe ha n'ọnọdụ ebe ha ga-abụzị ọkaịkpe bụrụkwa ndị otu ikpe (judge and jury). 9) Mgbukpọ na nkwafu ọbara (Genocide) A ga-akọ akụkọ agha Biafra ghara ikwute maka etu ihe ruru mmadụ nde atọ si nwụọ na ya bụ agha? Ndị mgbọ egbughi, agụụ egbuo ha, nke bụ otu atụmatụ gọọmentị Naịjiria jiri lụtanwuo agha ahụ. Onye kwuru na a gaghị anwali ijikwa usoro a gbukpọọkwa ndị mmadụ n'Ala Igbo ma agha ọzọ selite isi? Onye ga-anwụ, onye ga-afọ? Onye ga-ezu oke mgbe agha biri? Ndụ mmadụ agaghị abụzị ihe eji kpọrọ ihe. Agha na-ebute nnukwu nkwafu ọbara a gaara agbalahụ ma ọ bụrụ na ndị chọrọ ịlụ agha kwenye ịtụkọta isi kpaa ezigbo nkata maka ihe na-ese. 10) Ndakpọ Agụmakwụkwọ N'oge agha, kama ụmụaka ga-anọ n'ụlọakwụkwọ, ọtụtụ n'ime ha ka a ga-esoro ndị agha buru egbe Ọ kwa onye dị ndụ na-achọ akwụkwọ ọ na-agụ? N'oge agha Biafra, ndị dị ka Chinua Achebe bụ odeakwụkwọ mere ka ọha mara na ha ejighi Biafra egwu egwu site n'ịrịọ ndị Yurop na ndị Amerịka maka ọsọ enyemaka. O bughi akwụkwọ n'isi, kama ọ chọwara etu ọ ga-esi nyere ndị Biafra aka, ọ bụ mgbe agha bichara ka ọ kọwara ihe anya ya hụrụ. N'ime afọ atọ e jiri lụọ agha Biafra, mmadụ ole hụrụ ohere iji chọọ ihu akwụkwọ maọbụ ụlọakwụkwọ ha ga-aga? 11) Ndịagha bụ ụmụaka Oge ọbụla agha dara, ọtụtụ ụmụ ntakịrị, ọ kacha ndị nwoke, ka a na-adọbanye ka ha soro buru egbe lụwa ọgụ. Ọ naghị abụkarị ọnọdụ ""sonye ma ọ masị gị"", ọtụtụ oge ka ọ na-abụ ""Ị ga-esonyerịrị ma ị chọrọ ma ị chọghị"". Onye ga-achọ ka nwa ya maọbụ nwanne ya na-akabeghi aka nọrọ n'ụdị ọnọdụ a? Ụmụaka Biafra: Etu ndị etobeghi ntoroọbịa jiri hụ agha Ihe ndị ọzọ gụnyere: Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo" afirika-44050399,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44050399,Ndị Kọstọm akpachiela onye tụbatara ọgwụ Tramadọl,Ngalaba na-ahụ maka mbupu na mbubata ngwaahịa na Naịjirịa a na-akpọ Kọstọm kwuru na ha akpachiela ngwaahịa dị n'igbe igwe abụọ nke ọgwụ Tramadọl juru n'ime ya e si mba Ịndịa zubata.,"Ndị kọstọm na-amachi ndị niile na-ebubata ngwọahịa megidere iwu Onyeisi ndị Kọstọm nke Tincan Island bụ Musa Abdullah kwuru na mmachi ahụ ha mere bụ maka na gọọmenti etiti amachịela mbubata ọgwụ codeine. Ndị kọstọm jidere igbe ngwaahịa dịka a na-achọ ibupu ya n'ọdọ ụgbọ mmiri. N'okwu Abdullah; ""Agbanyeghi mbọ a na-agba ịkwụsị mbubata ọgwụ ike na Naịjirịa, ụfọdụ ndị ahịa jụrụ nchegharị ka na-eme arụ ahụ. Igbe ngwọahịa abụọ bu ọgwụ Tramadọl Hidrokloraid 225mg ka anyị jidere, anyị na ndị NAFDAC na ndị NDLEA rụkọrọ ọrụ ijide ndị ahụ."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43918182,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43918182,Kwụsịnụ ịta Chidoka na Abaribe amusu maka Nnamdi Kanu - IPOB,"Ndị otu akpọrọ Indigenous People of Biafra, IPOB, n'ichafụ agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị amusu a na-ata onye bụbu onyesisi n'ihe gbasara njem ụgbọelu, Osita Chidoka na Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite Abia Saụt na sineti.","Nnmadi Kanu na-akatọ gọọmenti etiti maka mmegbu okwuru na ana-emegbu ndị Igbo Abaribe na Chidoka bụ ndị tinyere onyeisi IPOB bụ Nnamdi kanu aka n'akwụkwọ nnaputa. N'akwụkwọ onye na-ekwuchitere IPOB ọnụ bụ Emma Powerful depụtara, o kwuru na onye ọbụla si na pati APC maọbụ ndị otu ọchịchị gọọmentị etiti na-emegide ndị na-akwado Nnamdi Kanụ achọghị ọdimma obodo Naịjirịa. IPOB kwetere na ọ bụ gọọmentị etiti ji Nnamdi Kanu Powerful kwukwara n'akwụkwọ ahụ na ọ bụ ihe mwute na onye ọbụla na-akwado Nnmadi Kanu nọ na mmegbu. Ọ sị na ọ bụ ihe na-agbawa obi na Chidoka na Abaribe ga na-ata ahụhụ makana ha na-akwado onyeisi IPOB. N'ọnụ ya, ""Amusu a na-ata Chidoka na Abaribe kwụsị ugbua ma ọ bụrụ na ndị APC achọghị nsogbu. Anyi agaghị awakpo onye ọbụla mana ọ bụrụ na gọọmentị etiti chere na ha ga na ata ndị Igbo ahụhụ na nkịtị, ha na agaghie ụzọ.'' Ndị IPOB na-achọ nwere onye nke Biafra ""IPOB achọghị ịma maka ihe na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa mana anyị agaghị anọ na-elele ka a na-emegbu nwafọ ọwụwa anyanwu ọ bụla site n'iji EFCC majaa ha"". Ọ jụkwara n'akwukwọ ahụ ihe kpatara na anaghị akpatụ onye Fulani ọbụla so na mmerụaka aka mana a ga-anwụchị ụmụ Igbo were ha na-eme ihe akaja maka na ndị Igbo enweghị ọnụ okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. Ndị agha Naịjiria wakporo be Nnamdi Kanu na Septemba 2017 O kwuru na IPOB agaghị anabata agwa ọ bụla gosiri na-achọrọ ịnapụ ike nnọchite anya nke Sinetọ Abaribe. ""Anyi na-agwa ndị ji ọchịchị Muhammadu Buhari ka ha buru ọgụ ha na-aluso mpụ na mmerụaka gawa n'ugwu makana ọ bụ ebe ahụ ka ya bụ ndị na-eme mpu karịrị akarị."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-54502747,https://www.bbc.com/igbo/media-54502747,'Achọrọ m iji egwuregwu 'gymnastics' gaa Olimpiks - Stephanie,"Ịkụ ụgba bụ ihe a na-ahapụrụ ụmụnwoke na ndị mmonwụ n'ala Igbo, ọ bụ ihe e jiri mara ndị mkpọkịtị.","Mana mgbe nwatakrịrị nwaanyị gbara afọ itoolu malitere kụwa ụgba, mara na ihe dị na ya. Nne na Nna Stephanie Ogechukwu Onuzuruka che na ọkpụkpụ adịghị ya n'ahụ mgbe ọ malitere ịkụ ụgba ka ọ gbara naanị afọ abụọ. Mana ka e mechara ghọta ihe dị na ya, ha malitere ịkwado ya nke bụ na ọ gaala ofesi turu ugo lọta. Lee Ogechukwu na nne ya ka ha kọọrọ gị ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghụrụ. Ndị mere akụkọ a: Chimezie Ucheagbo na Vining Ogu" afirika-45967475,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967475,2019 Election: Okorocha asaala APC okwu ha gwara ya na ọ dara ada,Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onye odeakwụkwọ mgbasa ozi pati APC bụ Lanre Issa Onilu ezipụla ozi ọjọọ banyere APC na mbaụwa.,"Okwu a bụ na nzaghachị okwu Issa kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ APC anabataghị mmeri e meriri ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na nso nso a. Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ sọ ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC. O kwuru nke a dịka otu ụlọịkpe n'Abuja mapụrụ ikpe dị n'etịtị Uche Nwosu na Hope Uzodinma bụ ndị abụọ meriri ntụlịka imeụlọ n'Imo iji zọọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC. Nke a pụtara na n'uche Rochas, sọsọ Nwosu ga-azọtara APC Imo steeti na 2019. Akukọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43529350,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43529350,Onye uweoji ji onwe ya chụ aja anwụọla,Arnaud Beltrame bụ onye uweoji mba France nyere onwe ya ka onye jichiri ndị mmadụ were tọghapụ otu nwaanyị mgbe a wakporo otu ụlọahịa n'obodo Trèbes.,"Onyere onwe ya ka a tọghapụ otu nwaanyị ejichiri Nwoke ahụ enyere aha ya bụ Redouane Lakdim gburu mmadụ atọ tupu o jiri Beltrame gbochie onwe ya mgbe ndị uweoji malitere ị gba ya egbe. Beltrame nwụrụ site na mgbọ ndị ahụ bara ya ahụ. Ndị mmadụ nọ na-egosi nwute ọnwụ ya wutere ha n'elu igwe okwu Twitter: End of Twitter post, 1 Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45931528,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45931528,Biafra ka anyị mkpa karịa nchutu Buhari - IPOB gwara Kayode,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Ọkaiwu Nnamdi Kanu, onye ndu Ipob bụ Aloy Ejimakor ekwuola na onweghi mgbe Kanu na onye bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode ji kwekọrịta iwepụ Buhari n'ọchịchị. O kwuru na mkparịta ụka ha abụọ n'ekwentị bụ naanị ozi ekele na onweghi ihe ọzọ ha kwuru banyere ọchịchị. Cheta na Kayode site n'akara Facebook ya dere na ya na Kanu ga-agbakọ aka ọnụ iji chutuo onyeisiala Buhari n'ọkwa ọchịchị. n'aka nke ọzọ, mpụtagharị ihe Nnamdi Kanu ebutele oke arụmụka n'etiti ndị mmadụ na Naịjirịa karịsịa na mpaghara ọwụwanyanwụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe obi ụtọ nye ha ebe ndị ọzọ sị na ọ ga-emebi usoro ntuliaka afọ 2019. A na-anụ kepukepu na Kanu ga-ekwu okwu n'igwe Redio Biafra n'elekere isii nke abalị taa. Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu igwe mmadụ n'obodo Kasuwan Magani nke Kaduna Steeti ma kwuo na ị dị n'otu bụ ihe dị ezigbo mkpa. Ọgbaghara a nke dapụtara n'etịtị ndị ntoroọbịa ụka Kraịst na nke Alakụba tara ihe ruru isi mmmadụ iri ise na ise. Na mba ofesi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola ha ga-ewezuga onwe ha na nkwekọrịta dị n'etiti ha na mba Rọshịa banyere nwaagha nuklịa. Trump kwuru na Roshịa adaala iwu na-echekwa nkwọrịta a, bụ nke mba abụọ ndị a mere n'afọ 1987. Rọshịa agọnarịla ebubo a ma kwuo na Amerịka na-eme nke iji kpachikọọ ikike na mba ụwa niile. N'egwuregwu: Otu egwuregwu bọọlụ Barcelona ekwuola na onye nke ha bụ Lionel Messi agaghị agba bọọlụ site ugbua rue izuụka atọ na-abịa site n'aka ọgbajiri mgbe ha na otu Sevilla zutere n'abalị ụnyaahụ. Messi nyere ọtụ ọkpụ goolu tupu ọdachi a abịara ya. Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Gala boy: E kerem ndị mkpọrọ gala m na-ere maka na anọtụalam ọnọdụ ahụ" media-52658479,https://www.bbc.com/igbo/media-52658479,Coronavirus Update: Ihe mere m ji agụrụ ndị m na-agwọ covid 19 egwu- Dọkịta Igwe,"A na-ahụ ndị dọkịta ka ndị ọrụ ha bụkarịrị inye ọgwụ, gwọọ ọrịa dgz.",Mana dọkịta Michael Igwe bụ dịbia bekee agbanwetụla nke a site n'ijikwu ma egwu wee nyere ndị ọ na-agwọ ọrịa covid- 19 aka ikpalite mmụọ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55379843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55379843,'Iji ọkụ ese nka masịrị m nke ukwu' - Hanson Okere,Ihe nka dị iche iche kama nke Hanson Okere pụrụ iche.,Nwaafọ Igbo a na-eji ọkụ ese ihe nke gbara ọtụtụ ndị mmadụ gharịị. Ọ bụ atụmatụ akpọrọ 'Pyrography' ka o ji ese ya bụ nka. Lee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a: Akụkọ a sị n'aka Jessica Nwankwo na Vinning Ogu 43237847,https://www.bbc.com/igbo/43237847,A kpụpụla Melaye ụlọikpe maka ịgba akabe ụgha,Otụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Sinatọ jupụtara ụlọikpe iji gosi nkwadọ ha nwere nye onye ụlọ omeiwu ukwu bụ Dino Melaye.,"Dino Melaye Melaye na-aza ikpe n'ụlọikpe ukwu n'Abuja maka ịgba akaebe ụgha. Ọ bụ ọkaịkpe Olasumbo Goodluck nọ n'isi oche n'ulọikpe a. A na-ebo Melaye ebubo na ọ gbara akaebe ụgha n'ikpe na-enyocha ebubo na onye isi ndị ọrụ gọvanọ Kogi steeti bụ Edward Onoja, chọrọ igbu ya. Ndị Sinatọ dịka Philip Aduda, Shehu Sani, Tayo Alasoadura na Ben Murray-Bruce so na ndị soro bia ụlọikpe ịkwadọ Senator Melaye. Ha ka nọ n'ụlọịkpe ugbua. Akụkọ ka na-abia" afirika-49984172,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984172,Nne gi na nna gị akuziiri gi maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị?,Ndị ntoroọbịa kwuru etu ha si mata ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị.,"N'oge ugbua, ndị ọkachamara na-ekwu na ọ dị mkpa ibido n'oge kuzibere ndị ntoroọbịa maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Nke a bụ iji mee ka ha mata ọghọm dị na okoro erughị eru wara ọgọdọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-56679557,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56679557,Kaduna Anglican Kidnap: Etu e si tọrọ ụkọchukwu na ndị ụka Anglịkan si agbamakwụkwọ alọta,Bishọp ụka Anglịkan na mpaghara Wusasa dị na Kaduna steeti bụ Buba Lamido akọọrọla BBC etu ndị ntọ si tọrọ ndị ụka ya.,"Bishop Lamido kọwara na mwakpo ahụ mere dị ka ndị ụka ahụ nọ n'ime ụgbọala si agbamakwụkwọ alọta. O kwuru na otu onye ụkọchukwu so na ndị a gbara egbe mana ọ nọ n'ụlọọgwụ ugbua. O kwuru na rue ugbua, ndị ụka niile nọ n'ekpere maka nzọpụta ndị atọọrọ ma kwuo na ha enweghi olileanya ọbụla n'aka ndị uweojii gbasara nzọpụta ndị ahụ. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47523588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47523588,Ethiopia Airline Crash: Ndị otu anyị so n'ụgbọelu ahụ kpọriri akpọri - UN,"Ihe mberede ụgbọelụ dara n'ụtụtụ ụbọchị iri nke ọnwa Maachị 2019, emetụtala ụlọọrụ United Nations dịka ha si gwa onye ntaakụkọ BBC.","Mmadụ ruru otu narị na iri ise na asaa (157) nwụrụ na ya bụ ihe mberede. Etu ọ dị ugbua ndị ụlọọrụ UN kwuru na ndị otu ha nwụrụ n'ụgbọelu a nwere ọdachi, kwesịrị isonye n'ọgbakọ gbasara gburugburu obibi ha na-eme n'isi Obodo Kenya bụ Naịrobi taa. Satya Tripathi bụ odeakwụkwọ ngalaba a, kwuru na ha achọbeghi ịkpọpụta aha ndị otu ha, ruo mgbe ha mechara nyocha. Ha mechara daa nkịtị otu nkeji, iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu. Ha mekwara mbudata ọkọlọtọ iji kwanyere ndị otu ha nwụrụ anwụ ugwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48371610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48371610,Nwatakịrị a tọọrọ ka ọ na-edugharị ndị isi na-ariọ aririọ,"Samuel Abdulraheem dị afọ asaa mgbe a tọọrọ ya, mana onweghi ihe o nwereike icheta banyere ụbọchi a tọọrọ ya n'ụlọ ha dị n'obodo Kano nke Naịjirịa.","Nna Samuel lụrụ ụmụnwanyị anọ ma mụtakwa ụmụ iri na asaa. O furu afọ isii tupu a hụ Samuel anya ọzọ site na mgbe ọ nọ na-anya inyịnya igwe ya a tọọrọ ya. Ọchụchọ Samuel Dịka nwanne ya nwaanyị aha ya bụ Firdausi Okezie na echeta sị, ""anyị mere ihe niile anyị nwereike ime ịhụ na a chọtara ya"". Firdausi ka bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na otu mgbe a tọọrọ Samuel. O chetara mgbe o si ụlọakwụkwọ mahadum lọta, a gwa ya na nwanne ya nwoke bụzị onye a na-achọ achọ. Na mbụ emeghi ka nne Samuel bụ onye nọ na Foto a mara na nwa ya na-efu efu O chetara mbọ ha gbara n'ịchọ nwanne ya. O chetakwara na ha kpọchiri onye na-elekọta Samuel, chọọ ya gburu gburu niile ma tinyekwa foto ya n'akwụkwọ mgbasa ozi. Ha gakwara na nke ndị alakụba na-ahụ na mmụọ, mana ihe ndị a niile bụ n'efu. Ezinaụlọ a mechara kwere na Samuel bụ ọnye lara ala. Olileanya na ihe ebube Firdausi nwere olileanya, nwaada a mechakwara were ofufu nwanne ya nwoke dee ihe edemede ule Mahadum. Firdausi mechara bụrụ ọnye nke Kraịst, bido na-efe Chineke n'ụlọụka Winners Chapel nke dị n'Ogun Steeti. Kwa ọnwa Disemba ọbụla, ndị ụlọụka a na-enwe ọgbakọ ha na-akpọ ""Shiloh"" nke ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche abịa. Ọ bụ n'ọgbakọ ""Shiloh"" nke afọ 2000 ka Firdausi gara ire ahịa ma kpee kwara Chineke ka ọ nọ wee hụ otu onye isi nwantakịrị na-edu, o wee tipu mkpu mgbe ọ hụrụ na nwantakịrị du onye isi ahụ bụ nwanne ya nwoke furu efu; Samuel. Etu esi tọrọ Samuel Samuel etoola ugbua bụrụ nwoke dị afọ iri atọ. O kwuru na onweghi ike icheta otu e si tọọrọ ya. Naanị ihe onwere ike icheta bu na etinyere ya na ụgbọ oloko kpọgara ya otu nwanyi nwere nani otu aka nke bi na Lagos. Uwa Onye Ohu Nwanyi a na akpọpụ ya kwa ụbọchi, kpọgara ya ndi na ariọ arirịọ. Ha bu ndi aririọ na akwu nwanyi a hu Naira nari ise kwa ụbọchi ọ bụla samuel du ha kaharia irio aririọ. Naanị ya na nwaanyị a bị , mana ka afọ na aga, e nwekwara ụmụaka ise bịakwara binyere ụmụnwaanyị ndị ọzọ bụ agbata obi nwaanyị otu aka ahụ. Samuel kọwa kwara na ọ dịka enwere ihe emere ya n'ihi na onweghi ihe o chetara tinye kwara na ọdịghị mgbe o chetara ụmụnne ya ma ọ bụ nne na nna ya. ""Uche m lara ala, naanị ihe m maara bụ duru ndị arịrịo gagharịa, rịọta ego, rie nri , hie ụra ma malite kwa otu a kwa ụbọchi."" Samuel. Ọ na-ekwu na uche ndị arirịọ a na a dị ya mgbe ọbụla. Na dịka nwantakịrị, ike nwere ike ịgwụ ya ma mee ka ọ gafee ebe ndị mmadụ nọ mana ndị isi a nwere ntị ruru ala, ha na akpohachị ya sị ya na ya lahachi azụ na onwere ndị ha gafere. Samuel kwuru si "" echeghị m na ndị aririọ a dị njọ. Ọru ha agwụla naanị ibilite n'ụtụtụ bido riọ wa arịrịọ otu ndị mmadụ si ebido ejikere ị ga ọru"" Ihe Ọlụ ebube Na ọnwa Disemba ka otu ọnye isi Samuel na eduharị, nụrụ na ndị ụlọ ụka Winners chapel na eme ọgbakọ, wee kpọrọ ya gawa. Ebe a ka nkwenkwe nọ kwee ha were zute nwanne ya nwanyi. Akpata oyi wụrụ Firdausi mgbe ọ hụrụ nwanne ya nwoke, ọ nweghi ọnụ okwu. "" e tiri m mkpu daa n'ala"" Firdausa na-ekwu Ndi ọgbakọ gbatara ya ọsọ enyem aka jụwa ya si ""ọ bu gini"" . Firdausa jisiri ike gwa ha na ihea bụ nwanne ya nwoke furu efu kemgbe afọ isii. "" a matara'm na mụna ya metutara mana amaghi'm otu mu na ya si metụta"" samuel. Ndi ọgbakọ Shiloh gbaliri sapu samuel ahu, yiwe ya ezigbo uwe ma kpọputa ha n'iru ụlo ụka ka ha kwuo ihe iribaama mere ha. ọnye isi Ulọ ụka Winners Chapel kpọtara Samuel ma kpere ya ekpere. Ọ dị Firdausi ka legọs ọ bụzi Lọndọn, obi bụ ya sọ aṅụrị. Oge Samuel gbakere Firdausi na-ekwu na ihe na ewute ya bu na obi ụtọ ichọta nwanne ya mere ya ka ochefuo umuaka ndi ọzọ nọ n'aka umu nwanyi ndi ahu di ka ohu. Samuel kwuru na otebeghi anya nwanne ya zọputara ya, ka akpọtara otu nwa ntakiri ka o soro ha ma na nwatakiri ahu bewere akwa ma jukwa iri nri. O kwuru na nwatakiri a mechara nọrọ nwanyọ, samuel kwenyere na onwe ihe enyere nwata kiri a ka ọ mechie onu. Samuel na nwanne ya nwaanyị n'ụbọchị agbamaakwụkwọ ya, ihe dịka afọ abụọ ọ chọtachara ya 'ọ buru na ala nwere ezigbo ọchichi, ọnye udiri ihe a mere kwesiri i ga-kwuru ndi uweojii ka ha rụọ ọrụ ha , kama na Naijirịa, ha ka a si ka i weta ego mmiri mụọ maka ụgbọ ala ha ma ọ bụ ego maka ihe ọzọ"" Firdausi. Otito na ihe ndị ọzọ wukasiri samuel na ahu. A chọpụta kwara na elu aka ya lara ala site na aka ndi isi ahu na ebigide ya kwa ubochi. Nne ya ekwetaghi na ihea bu nwa ya mgbe ọ hụrụ ya n'ihi na ahụ afọzighi ya mgbe ọ hụrụ ya. ọ welitere aka ya elu were hụta ebumpụtaụwa di n'ahụ ya tupu ọ were kwete. Mgbe Samuel ghọrọ nwaakwụkwọ O siri ike ichọta ụlọ akwukwo ka anabata samuel n'ihi na ọ oruola afọ isii ọ gasọro akwukwọ. ọ bu otu nwanyi hụrụ ha mgbe ha putara na ọgbakọ Winners chapel kwetere nabata samuel n'ụlọ akwụkwo ya. Firdausi chọtara samuel ndi nkuzi ọzọ. Na n'ime ọnwa atọ, samuel sitere na prịmarị one banye prịmarị 4. N'ime otu afọ, ọ lere ule ""common entrance"" ma mee nke ọma banye sekondiri. Samuel Abdulraheem mere nke ọma n'agụmaakwụkwọ ya Samuel guru Sekondiịrị afọ atọ were lee ule ibanye mahadum ma meekwa nke ọma were banye ""Ahmadu Bello University, Zaria"" . Isi na anụ Samuel ọkụ, nke mere umu akwụkwọ ibe ya na a bia kwute ya ka ọnyere ha aka ma kuzie kwara ha ihe. Kama samuel metere onwe ya ihe ọjuo mgbe a jidere ya n'ule ebe ọ na edere nwata akwukwo ọzọ ihe n' ule. Nkea mere ka achụọ ya na mahadum. 'Iwe adịghị m n'obi' ""M kpata tu ego, a ga m alaghachi ụlọ akwụkwọ mahadum, ka m gụọ kọmputa sayensi"" ka samuel kwuru. Ugbua samuel na e bi ndụ ya na enweghị ilu n'obi ya maka na o kwetere na ihe mere ya na nwata bu ihe e ji kuziere ya ihe ga e me ya ka ọ buru ọnye hụrụ ndi madu n'anya. Na mbụ emeghi ka nne Samuel bụ onye nọ na Foto a mara na nwa ya na-efu efu ""O nweghi ihe mmadụ ga-eme ga ewutem, a na m ahụ zi ya dịka etu ụwa di. Anaghị m ebu ihe ọjọọ n'obi."" Nkea meziri ugbua, ọ hu ndi arirịọ, ọ na-ghi enye ha ego kama ọ na enye ha ihe oriri. ọ na akọwa na "" i nye ndị aririo nri, nri ahu ga erute nwatakiri du ha mana inye ha ego, ego ahu ga alara nani ọnye aririo ahu"" . Samuel bu n'obi na akụkọ ihe ọ gabigara na nwata ga ekuziri ndi mmadu na ụfọdi ụmụ aka na-edu ndi isi na arịọ ari rịo nwere ike i bu ụmụ aka no na ihe nkpa di ukwu ; "" ihụ nwatakiri du ọnye isi ario arirịọ,enyela ha ego ma gawa, biko lezie anya n'ihi na nwatakiri ahu nwere ike i bu onye i ga enyere aka"" Samuel." afirika-43770024,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43770024,E liri dike Biafra bụ Joe Achuzia n'abalị,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Akwa m ozu Joe Hannibal Ajuzie Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 A ga-edowe ahu dike Igbo jiri jee mba bụ Joe Oseloka Hannibal Achuzia na ala echi. N'elekere iri na abuo (12:00 am) nke isi ututu ka a ga-eli ya na obi ya dị na Idum ojeyi, umuezeyi n'Asaba. Ụmụakwụkwọ Chibok 15 n'ime 112 eji eji bụ ihe ka dị ndụ Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka Ozị na-eru BBC ntị ekwuola na ọ bụ nanị mmadụ iri na ise (15) fọrọ ndụ na mmadụ otu narị na iri na abuo (112) ụmụakwụkwọ Chibok a ka ji eji. Ahmed Salkida bụ onye so na ndị gara okwu maka ịtohapụ mmụaka ahụ kwuru nke a. Mana ọnụ na-ekwuru gọọmenti Naịjirịa sịrị na ha ka nwere olile anya na ụmụagbọghọ niile ndị ahụ ga apụtacha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onyeisiala mba Rọshịa akọọla ogbunigwe agbara na mba Sirịa Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ Onyeisiala mba Russia Vladimir Putin ji obi iwe katọọ ogbunigwe a ndị US, UK na France turu na Syria n'isi ụtụtụ a. Ndị mba ahụ ji ogwunigwe ndị ahụ atụrụ wee dọọ Syria aka na ntị maka ngwagha kemịkal ha ji gbuo ndi be ha n'izu gara aga. N'egwuregwu E merie Manchester City n'ime Asọmpi atọ ha gbarala na esepụghị aka Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana. Ụmụnwaanyị Ghana tụrụ ime n'aka ndị China na ụmụ ha n'ata ahụhụ" afirika-48483033,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48483033,Buhari OIC meeting: Ohaneze Ndị Igbo akatọọla njem Buharị mere na Saudi Arabia,Ohaneze N di Igbo katọrọ njem Buhari maka OIC,"Akụkọ dị mkpa: Nnia Nwodo onyendú Ohaneze Ndigbo Ohaneze Ndị Igbo akatọla njem onyeisiala Buhara mere na mba Saudi Arabia ngwa ngwa edochara ya n'iyi ọrụ. Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Chucks Ibegbu kwuru na Buharị ga-akọwara ndị Naijirịa ihe mere ojiri bụrụ ọgbakọ ndị otu alakụba akpọrọ Organisation of Islamic Countries (OIC) bụ ihe kacha mkpa iji bido ọchịchị ọhụrụ ya. Boko Haram akpaala mkpamkpa na Maiduguri Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ Na Sajeri dị na Maiduguri, otu ọlụọ ọlaa bụ Boko Haram agbasala ndị ụka alakụba gara ekpere ụtụtụ ma gbuo otu onye n'ime ha. Akụkọ kọrọ na ọtụtụ mmadụ meruru ahụ ebe ha na-agba ọsọ ndụ ha mgbe ndị omekataraihe pụụjọ a waporo ha. Akpọpụtala ndị nwụrụ na Virginia N'ofesi, ndị ọchịchị akpọpụtala aha mmadụ iri na abụọ bụ ndị nwuru n'aka onye egbu ara ọbara na Virgina Beach ụnyahụ. Mmadụ iri na otu ndị ahụ bụ ndị ọrụ na ya bụ ụlọọrụ ndị okpuru ọchịchị obodo ebe otu onye ọzọ bụ onye ọrụ ngo bịara ebe ahụ. Okocha gara ụlọikpe Aberdeen Akụkọ na-eru anyị ntị na-egwu na Nwafọ Igbo eji egwu bọọlụ mara bụ Jay Jay Okocha gara ụlọikpe dị n'Aberdeen, Scotland ịzara ọnụ ya maka ebubo ịbụfe ego mba ofesi n'afọ 2015. Okocha ekwubeghị ma ọ mere ya ka ọmeghị ya bụ ihe a na-ebo ya. Nkeji mgbede Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mwakpo ụlọ obibi gọọmentị dị na Virginia, mba Amerịka. Otu nwoke ewerela egbe dulaa ihe ruru mmadụ iri na abụọ mmụọ ma merụkwaa ọtụtụ ahụ n'ụlọ obibi gọọmentị dị n'obodo Virgnia Beach nke mba Amerịka. Ndị uweojii sị na nwoke kpara ike a so n'otu n'ime ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ gbara egbe n'etiti ọha ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na abụọ merụkwa ndị ọzọ ahụ. Ndị uweojii kwuru na a gbagburu nwoke ahụ dịka ya na ha na-agbarịta onwe ha egbe, mana mkpọ tụrụ otu onye uweojii n'ahụ. Ụbọchị 4 na 5 Juun bụ ezumike Gọọmentị etiti ewepụtala ụbọchị Tuzde na Wenezde bụ abalị anọ na ise nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike maka oriri Eid-Al -Fitr nke ndị Alakụba. Nke a pụtara na ndị ọrụ bekee, ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ a gaghị aga ọrụ ma ọ bụ ụlọakwụkwọ n'ụbọchị ndị a. N'okwu metutarakwara ndị alakụba Ndị uweojii na ndị otu Shi'ite chịpụrụ ya ụnyaahụ na Kaduna dịka ndị ha na-eme ngagharịiwe maka ịtọhapụ onyeisi ha bụ El- Zakzaky nke mere ndị uweojii ji gbaa anwụrụ anya mmiri. N'otu aka ahụ ndị otu a bukwa ngagharịiwe ha wụchie Abuja na-akpọ oku ka gọọmentị tọhapụ onyeisi ha. N'egwuregwu, Anya ụwa nọ n'obodo Madrid nke Spen ebe a ga-achọpụta otu egwu bụ ọka ibe n'ịgba bọọlụ na Yurope. Ịma aka a ga-adị n'etiti otu egwu Ịngland abụọ bụ Liverpool na Tottenham. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ihe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya." afirika-44963071,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44963071,Ụlọikpe dị n'Amerịka tupụrụ ikpe ndị IPOB n'ụlọikpe ha,Ndị otu Ipob si n'aka otu ụlọikpe dị na 'District of Columbia' (DC) na mba Amerịka kpụpụ gọọmentị etiti Naịjirịa ụlọikpe mbaụwa ka ha kwuru na ha kwesịrị iketa pasentị 40 n'ego Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Abacha zupuru.,"Ụlọikpe ahụ tupụrụ akwụkwọ ikpe a site n'aka Ọkaikpe Dabney Friedrich, maka na o kwuru na ha enweghị ụdịrị ikike ahụ maka na ndị gọọmentị Naịjirịa nwere iwu nnwereonwe na mba ofesi, nke Bekee kpọrọ 'foreign immunity'. Ipob gbara akwụkwọ a site n'aka Ọkaiwu Godson M. Nnaka bi obodo Texas, nakwa ndị ọkaiwu ibe ya, ka ha kwuru na ha chọrọ pasentị 40 n'ime nde dọla 550 anatara n'ego Abacha zuru. Ndị ha kpọrọ aha n'akwụkwọ a ha gbara gụnyere onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Lieutenant General Tukur Buratai, onyeisi ndị SSS bụ Lawal Daura, onye bụbu onyeisi ndị uweojii bụ Solomon Arase nakwa onye nọchitere ya bụ Ibrahim Idris. Ndị ọzọ bụ gọvanọ Abịa bụ Okezie Ikpeazu na nke Anambara bụ Willie Obiano. Ipob gbara akwụkwọ a n'Amerịka, ebe ha kwuru na a na-emegide ikike ha nwere dịka mmadụ, na-egburu ndị otu ha nakwa mekpaa ndị otu ha na-eme ngagharịiwe ahụ n'etiti 2016 na 2017. Ọ bụghị ụlọikpe mbaụwa dịka anyị deburu na mbụ, kama ọ bụ ụlọikpe dị n'Amerịka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43093220,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43093220,Nwunye Nnamdi Kanu: Gọọmenti Buhari tọhapụrụ m dim,A gwala Gọọmenti Naịjirịa ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu na-achọ mnwereonwe bụ Indigenous People of Biafra (Ipob).,"Isi ụlọọrụ nchekwa ala Naịjirịa kwupụtara na Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo nnupụisi megide Naịjirịa na-efu efu n'ọnwa Seputemba afọ 2017. N'ajụjụọnụ pụrụ iche ndị ntaakụkọ BBC Igbo gbara nwunye ya bụ Uchechi Kanu, O boro Gọọmenti Naịjirịa ebubo na ha mara ebe di ya nọ. Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị ha ji Nnamdi Kanu. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Chimezie Ucheagbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50078882,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078882,Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'',Ọtụtụ ụmụ Igbo na-azụ ma na-ere ahịa gbarụọla ihe na mmechi okeala Naịjirịa na mba ndị nke gọọmentị mechiri.,"N'ime nyocha BBC Igbo mere iji mata etu mmechi okeala a si metụta ha, ha kwuru na onweghi ahia ha na-azụta. Na nke a mere ha ji erezi ngwaahịa ha oke ọnụ, nke ndị na-azụ ha ahịa na-eme mkpesa banyere ya. Mana otu onye sị na nke a emetutaghị ya maka na ọ na-eji ụgbọelu ebubata ngwaahịa ya si na mba Chaịna. Kirie ihe ha kwuru n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-46708461,https://www.bbc.com/igbo/media-46708461,Dino Melaye: Ndị uweojii achọghị ịpụ n'ụlọ ya na-anwụchighi ya,Akụkọ dị mkpa: Dino Melaye na ndị uweojii,"Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ha agaghị esi n'ogige ụlọ Sinetọ Dino Melaye pụọ ma ọ bụghị ma ọ bịara kpesa onwe ya n'aka ha dịka o kwesịrị ime kemgbe. Mana na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV nwere n'ekwentị, Melaye kwuru na ọ bụghị omempụ, na ọ ga-egosi ndị uweojii onwe ya n'izu na-abịa mgbe ọ batara Abuja. Cheta na ndị uweojii na-ebo ya ebubo ịma maka ndị omekome gbara otu onye uweojii egbe. E liela Shagari: E tinyela ozu aka chịburu Naịjirịa bụ Shehu Shagari n'ala dịka ndị alakụba si eli ozu. Cheta na Shagari dị afọ iri itoolu na atọ nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba a, n'ụlọọgwụ dị n'Abuja ka ọ rịachara obere ọrịa oyi ịba n'ahụ a kpọrọ ""pneumonia"". Lee foto si n'olili ya: Gana mere ntuliaka Onyeisiala ndị mba Gana bụ Nana Akufo-Addo etoola ndị isioche ụlọorụ ntuliaka ha maka mbọ ha gbara ịhụ na usoro ndị mmadụ binyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka ekewapụta mpaghara ọhụrụ, gara were were. N'egwuregwu, Cristiano Ronaldo nyere goolu abụọ mere ka Juventus merie Sampdoria. Goolu a butere ole o nyere n'afọ 2018 a na iri anọ na itoolu, nke bụ mbụ ọ na-enyerughi goolu iri ise n'ime afọ asatọ gara aga. Egwu Eke nke atọ Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa akatọọla egwueke nke atọ ndị agha Naịjirịa kwuru na ha ga-amalite n'akụkụ Naịjirịa niile ka ha jikere maka nsogbu ọ bụla nwerike ipụta mgbe a na-akwado, mgbe a na-eme maọbụ mmecha ntuliaka 2019 na-abịanụ. Ndị agha Naịjirịa na-adị njikere maka Egwu Eke atọ Onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai, kwuru na egwu eke atọ ga-ebido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị ma kwụsị n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị. Ndị agha Naịjirịa kwuru maka ya bụ Egwu Eke na Twitter:‏ Lee ihe ha kwuru na Twitter @JabeerJaiz kwuru na ọ na-atụ anya na ya bụ emume ga-aga nkeọma Ebe ụfọdụ ụmụ Igbo na-ekwu na ọ bụ maka ndị Biafra ka gọọmenti ji ehibe ya bụ ""Egwu Eke atọ"" @Michaelche4 kwuru na ya bụ atụmaatụ bụ iji memina ụmụ Naịjịrịa. N'akụkọ ọzọ, APC napụrụ PDP ọchịchị n'afọ 2015 Ndị otu pati All progressives progressives akpọrọ APC n'ichafu site n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Lanre Issa-Onilu ndị na-ekwuru ha etiela pati PDP aka n'obi. Ọ bụ maka ụfọdụ ndị otu ha nwụrụnụ na mberede okporoụzọ mgbe ha gara i so onye otu ha na-azọ oche sineti na Benue steeti achụ nta vootu. N'ọnụ ha, anyị bụ ndị otu pati APC nwere mgbawa obi maka ihe mberede a mere ndị otu pati PDP, n'ekpekwa ekpere ka Chukwu nọnyere ndị bee ihe a mere. Ndị otu APC na-arịọkwa dịka emume ndọrọndọrọ ọchịchị gbagotere, ka ndị ọrụ nchekwa na ọrụ na-ahụ njem okporoụzọ kpachapụ anya hụ na emume ndị a enweghị ọdachị ọ bụla. Ọ bụghị mbụ ana-atọ ndị ụkọchukwu Katọlik Ndị uweojii nọ na Anambara ekwuola na ha azọpụtala ụkọchukwu Katọlik abuọ ndị ntọ tọrọla ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Disemba 2018. N'ime akwụkwọ ozi onụ na-ekwuchitere ha bụ Haruna Mohammed degara ndị ntaakụkọ, ha kwuru na njikọta aka ha na ngalaba uweojii ndị ọzọ dị na steeti ahụ mere ka azọpụta ndị ụkọchukwu ahụ ndị ntọ tọrọ. Ndị Uweojii na Dino Melaye Ibrahim Idris na Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchite anya ndị Kogi West na-akwata ya maka ebubo mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchiri boro ya Anyị agaghị apụ na bee ya maọbụrụ na anyị anwụchịghị ya. Ọ bụ ndị ụweojii gbara ụlọ Abuja onye na-anọchite anya ọdịda anyanwụ Kogi steeti n'ụlọomeiwu bụ Dino Melaye kwuru nkea. Tupu ugbua, ndị uweojii kpọpụrụ Melaye n'ụlọikpe maka ebubo na ha nwetara ngwọagha n'aka ya. Mana Dino Melaye agwaala ndị ntaakụkọ ""Channels"" na ya anaghị agba ọsọ kama na ya ga-ewere onwe ya nye n'aka ndị uweojii n'izu ụka na-abịanụ. N'Egwuregwu, Ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị adịla njikere maka ị mata Mbe nabụ nke bụ oke n'etiti Liverpool na Arsenal na mgbede taa bụ ụbọchi iri abụọ na itoolu nke ọnwa Disemba 2018 n'asọmpị Premier League. Liverpool emeriela asọmpị iri na isii n'ime iri na itoolu ha gbagoro kamgbe a malitere asọmpi Premiere League nke izu a. N'Ofesi, Ndị uweojii na-enyocha ya bụ ụgbọala gbatọsiri agbatọ Ọgbunigwe gbara n'okporoụzọ agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ iri na abụọ nọ n'ime ụgbọala na Giza Pyramids dị na mba Egypt, ndị ọrụ gọọmenti ekwuputala. E zoro ya bụ ogbunigwe n'akụkụ mgbidi tupu ọgba mgbe ndị a na-agba n'okporoụzọ. Nkeji Ututu Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze'" afirika-51741099,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51741099,Hope Uzodinma: Aga m ebido ịgbasa oziọma APC n'Ọwụwa-anyanwụ,"Dịka o merichara n'Ụlọikpe Kachasị n'ikpe ya na Emeka Ihedioha, Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Ụzọdinma ekwuola na ọrụ ya ugbua bụ idozi ihe ndị mebiri emebi na steeti ahụ.","O kwuru na ya achọghị ka ya na onye ọbụla nwee esemokwu kama ọ bụ ịrụrụ ndị Imo ọrụ. Uzodinma, onye kwuru nke a n'ehihie Wenezde na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Channels TV, gara n'ihu kwuo na ya ga-ebido ịgbasa oziọma APC. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru: Akụkọ ga-amasị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Security in Nigeria: Ihe Buhari kwesịrị iji achụ ndịisi nchekwa na Naịjirịa" afirika-43962480,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962480,Gọọmenti amachiela ọgwụ ụkwara nwere codeine,Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike enyela iwu ka NAFDAC bụ ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naijiria machie inye ikike ịtụbata codeine na Naijiria maka ime ọgwụ ụkwara.,"Codeine, ọtọmegbum Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Ịsaac Adewole meere ka amata nkea n'ụlọọrụ n'abụja n'ụbọchị Tuusde. Ọ sị na ihe mere o jiri dị mkpa ịmachi ọgwụ nwere codeine bụ maka mkpamkpa oke ịṅụ ọgwụ a na- akpa na Naijiria ọkachasị n'Ugwu-Awụsa. O nyekwara iwu ka PCN na NAFDAC lebanye anya n'ịkpọghachị ọgwụ ụkwara nwere codeine. Cheta na akụkọ nchọpụta nke BBC mere gosiri ka ọgwụ ụkwara nwere codeine si akpa mkpamkpa na ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44584192,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44584192,Akụkọ kachasị n'abalị a: Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet Ndigbo,I he ndị dị mkpa n'abalị a,"Super Eagles nke Naịjirịa emeriela 2 - 0 Ahmed Musa nyere Aisland goolu abụọ Naịjịrịa na Island akwatara ya n'Iko mbaụwa na Rọshịa na mgbede a ebe Brazil gbara Costa Rica ọkpụ abụọ asataghị otu. Aịsland riri penariti ha ebe Ahmed Musa nke Naịjirịa tinyere ọkpụ abụọ na ọnụ goolu ndị Aịsland. DSS Jidere Sen Enyinnaya Abaribe Enyinnaya Abaribe bụ onye na anọchite anya ndị Abịa Saọt na ụlọ omeiwu ụkwu Naịjirịa Ozi na-eru BBC nti n'ehihie taa na-ekwu na ndị DDS akpurula Enyinnaya Abaribe. Ka ọ dị ụgbụa ekwubeghị ihe ejiri kpụrụ ya mana BBC na-agba mbọ iwetere ụnụ ozi ya ka ọ na-apụta. El-Zakzaky: Ndị Shi'ite egbuola otu onye uweojii na Kadụna Na mba ofesi, Mba Kongo gbara ndị 161 n'ime 175 bụ mba kacha eme mpụ na ngarị n'afọ 2017 N'mba ọzọ, US amachipụla ndị ọnụ na-eru n'okwu na mba Kongo bụ ndị na-etinye aka na-mpụ na nagarị dị iche iche ịbata be ha. Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet ndị Igbo Ndị ọmeiwu Naịjirịa Otu kpọrọ onwe ha ọgbakọ ụmụnna nọ na Kanada etiela ndị nnọchite anya ndị Igbo n'ụlọ ọmeiwu Naijịrịa mkpu n'isi ka ha bụ okenye siri nọrọ n'ụlọ ewu mụọ n'ọgbụ. Obi adịghị ndị Igbo mma kemegbe Onyeisiala Mụhammadu Buhari kwuchara na ndị omeiwu a chapụrụ ihe n'ego etinyere na bọjeti maka ọrụ mmepe n'ala Igbo. Gee nkeji nke abalị a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ." afirika-54202446,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54202446,Gọọmenti Uzodinma sị azụ ụlọ mịbata ahịrị iwu a na-ese okwu - Frank Ugboma,"Onye omeiwu na-anọchịte Oguta n'Ụlọomeiwu Imo steeti n'aha otu PDP bụ Frank Ugboma aghọọla aka na ụkwụ ya n'ebubo na ọ bụ ya wepụtara iwu ọhụrụ nyere gọvanọ Imo state ikike ịnwụchị onye sọrọ ya mgbe ọ sọrọ ya si na ọ bụ ""aka Esau"" webatara ya.","N'akwụkwọ mgbasaozi nke omeiwu ahụ binyere aka, o kwuru na ọ bụ ezie na ya wepụtara iwu mana o nweghị akụkụ n'ime iwu ya wepụtara nwere ebe o nyere gọvanọ ikike ijichi onye masiri ya mgbe ọ masịrị ya. "" Ihe a abụghị iwu m wepụtara ma kwado. "" "" Ọ sịrị, ""Iji doo onye ọ bụla anya, e wepụtara m iwu gbakọtara nwee akụkụ 372."" ""Etu na ebe e si megharịa ya nwee tinye akụkụ 484 bụ ihe mgbagwoju anya."" Ugboma, onye bụ onye ọkaiwu gara n'ihu kwuo sị na oge ya kesara ndị omeiwu ibe ya akwụkwọ iwu ya webatara, oge a gụrụ ya nke mbụ na nke abụọ, n'akụkọ ahụ ' jọgburu onwe ya ma na-emekwa ihere bụ nke 484, adịghị ya. O kwukwara na o nweghị onye kpara maka ya bụ akụkụ na kọmiti e hiwere n'ụlọomeiwu Imo steeti. Ugboma kwuru na dịka ọkaiwu nakwa onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye, ""o nweghị ka ụdị iwu a lafere n'ọgbakọ ụlọomeiwu nke Itoolu m so na ya."" Ọ gara n'ihu kpokuo ndị ogbo ya ndị omeiwu ka ha nyocha ebe mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ ma hazigharịa iwu ahụ. 'Ọ bụ onye PDP wepụtara atụmatụ iwu nyere Ụzọdinma ikike nwuchi onye sọro ya' Iwu Imo Onye ndụmọdụ onyeisi ndị omieiwu n'Imo steeti banyere mgbasa ozi bụ Emeka Ahaneku gwara BBC n'iwu na-ese okwu na steeti ahụ abụghị iwu ọhụrụ. Maazị Ahaneku sịrị na ọ bụ n'ọchịchị Emeka Ihedioha - bu onye ulọikpe ukwu na Naịjirịa chụtụrụ n'ọchịchị - ka iwu malitere njem. 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ' ""Ọ bụ omeiwu na-anọchịte Oguta bụ Frank Uboma wetere atụmatụ iwu a dịka n'usoro a na-akpọ ""Private Bill"" n'oge Ihedioha na-achị."" N'ime iwu a nke Gọvanọ Hope Uzodinmma tinyere aka na ya, o nwere ngalaba nyere gọvanọ ikike inwuchi onye ọbụla ọ chọrọ mgbe ọbụla, n'etu ọ bụ o si masị ya. Iwu ahụ nyekwara ya ikike idosa onye ahụ a nwuchiri n'ebe ọbụla maọbụ n'ọnọdụ ọbụla masịrị gọvanọ ahụ. Maazị Ahaneku sị na iwu a gara njem niile o nwereike ịga n'ụlọ omeiwu tupu e were ya nye kọmịti mmadụ itoolu nke gụnyere ndị ọkanmụta abụọ tupu e were ya nye gọvanọ ka o binye aka. N'ịza BBC azịza banyere iwu, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Uzodinma bụ Uguwike Nwachukwu sị na ya amaghị ihe mere ndị mmadụ jiri kpụrụ onyeisi ya n'ọnu banyere iwu a. Nwachukwu sị: ""Amaghị m na Gọvanọ Hope Ụzọdịnma hibere iwu ọbụla bụ nke ""Executive"" n'ọnọdụ a dịka ụfọdụ ndị afọ ọjọọ na-ekwu. Iwu a na-ekwu okwu ya bụ nke onye omeiwu ji aka ya wepụta ma bụrụkwa nke ndị PDP nọ n'Ụlọ Omeiwu Imo kwadoro ọfụma n'oge ahụ."" O kwenyekwere n'ihe Ahaneku kwuru na ndị ọkanmụta n'ihe banyere iwu tinyere ọnụ n'iwu a. ""Ndị isi ha gbagotere n'iwu nyochara atụmatụ iwu a mana ajụghị ajụjụ banyere ọrụ ha rụrụ."" Ọ sịkwa: ""Iwu a abụghị iwu ọhụrụ. Ọ bụ iwu e si akara 401 na Criminal Procedure Law"" nke Naịjirị bịa.""Mana, nnyocha BBC gosiri na iwu ""Criminal Procedure Law"" bụ maka ndị a na-ahụ dịka ndị mpụ na nrụrụaka. Iwu a akpụ n'ọnụ ekwughi maka ndị mpụ na nrụrụaka. Uguwike sị na ""Ụzọdịnma, dịka onye bụbu onye omeiwu, ma maka iwu a na ihe ọ bụ karịa ndị ji ya eme ihe ndọrọndọrọ."" Ọ sị na ndị na-eche na iwu bụ nke eji emekpa ahụ ma na iwu a dị kemgbe ma bụrụkwa nke ọtụtụ steeti binyekwere aka. Oguwike sị na Uzodinma ma maka mmegide ikike dịrị onye nakwa usoro onye kwuo uche ya na mba dị ka Naịjirịa, nke mere ịsụ mma n'azụ banyere okwu agaghị akwụrụ. Ahaneku n'onwe ya sị na dịka Ụlọ Omeiwu Imo nọ n'ezumike ugbua, na ha ga-etinye anya n'iwu ma ha lagachite. Mbọ niile BBC gbara inwete Frank Uboma amịtaghị mkpụrụ." afirika-47586933,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47586933,Building collapse: Ihe isii mere ọtụtụ ụlọ ji ada,"Dịka ụlọ dị na Legos nke Naịjirịa dachara ma gbuo ihe ruru mmadụ 11, nke gụnyere ọtụtụ ụmụakwụkwọ ụmụaka na-aga n'ụlọakwụkwọ dị n'elu elu ụlọ ahụ, anyị na-eleba anya n'ihe na-ebute ụdị mberede ndị a, karịsịa n'ụfọdụ mpaghara Afrịka.","Ụmụaka si n'ụlọakwụkwọ dị na Legọs ka nwereike ịtọ n'ime ụvụrụ ụlọ ahụ Dịka nyocha ka na-aga n'ihu iji mata ihe butere ụlọ ahụ ịda, ndị injinịa gwara anyị ụfọdụ ihe nwereike ibute nke a. 3. Ntọala na-esighi ike I hiwe ntọala ziri ezi nwereike ị dị okeọnụ Ha nwereike ifu ego ole a ga-eji rụọ ụlọ, ọkanmụta n'injinịa na-arụ ụlọ bụ Anthony Ede nke Mahadum Covenant dị n'Ọta, Naịjirịa kwuru nke a n'afọ 2016. O kwuru na ihe abụọ a ga-eleba anya na ntọala ụlọ bụ ikikere aja siri na arọ ụlọ na ihe dị n'ime ya dị. Na Legọs, juputara n'ala apịtị kwesiri ka e jiri ntọala siri ike rụọ ụlọ. Nke siri ike karịa ala n'onwe ya. Mana o kwuru na ndị ọrụ ụlọ na-akpị aka n'ego ekwesiri iji arụ ntọala siri ike nke butere ọtụtụ ụlọ ji ada n'obodo ahụ. Ọ bụnarị n'ala siri ike, ntọala ụlọ kwesiri i si ike maka ibu o nwereike ibu. Ihe karịrị mmadụ 30 bụ ndị azọpụtara na ndụ dịka ụlọ dachara na Nyagatare dị na Rwanda n'afọ 2013. 2. Akụrụngwa ndị eji arụ ụlọ anaghị esi ike nkeọma Akụrụngwa na-esighi ike ibuli ibu ndị nọ n'ime ụlọ bụ ihe eji arụ ụlọ oge ụfọdụ, Hermogene Nsengimana si n'African Organisation for Standardisation kwuru n'afọ 2016 na otu ahụ zukọrọ iji mata ihe mere ọtụtụ ụlọ ji ada n'Afrịka. Ụlọ dara ada gburu ihe ruru mmadụ 33 na Nairobi n'afọ 2016 O kwuru na ụfọdụ ndị ọrụ ngo na-ama ụma were ngwaọrụ adịgboroja rụọ ụlọ iji belata ego. Ya mere ha na-eji igwe a ga-eji arụ otu ogogo ụlọ elu arụ ogogo ụlọ elu anọ. O kwuru na ihe a bụ ihe ndị nyocha anaghị etinye anya na ya. 3.Ndị ọrụ na-azọghie ụkwụ Ndị na-arụ ụlọ na-enwete ngwaọrụ dị mma mana ha amaghị agwakọ ya dịka Maazi Ede si kọọwa. Nke na-ebute kọnkịrị na-agaghị akwadoli ụlọ ahụ. Ede bokwara ndị na-enwete orụ ngo ịrụ ụlọ ebubo maka ịkpọta ndị adigboroja ọnụ ego ha pere mpe karịa ndị ọrụ azụrụ nkeọma. Ọ bụ ụdị agwa dịka ndị Inginịa abụọ bụ Henry Mwanaki Alinaitwe na Stephen Ekolu kọwara butere ụlọ dara na Uganda, Ụlọ ahụ daranụ nwere ogogo ise ma bụrụkwa ụlọ oriri mgbe ọ dara gbuo mmadụ 11. Ụlọ daralanụ na Naịjirịa kamgbe afọ 2012 4. Ụlọ na-ebu ibu karịrị ya Maazị Ede kwuru na ụlọ na-ada maọbụrụ na eboro ya nnukwu ibu. O kwuru na nke a dịka obere nwa eboro nnukwu akpati na-agaghị ebuli ibu ahụ. Ede kwuru na mgbe ụfọdụ ndị mmadụ rụọ ntọala ga-ebu otu ogo ụlọ, ha were ogo atọ maọbụ anọ tụkwasị ya. O ji ụlọụka Synagogue nke TB Joshua bụ onye nchịkọta ya maa atụ na-ekwu na ihe mere ụfọdụ akụkụ ụlọụka ahụ ji daa bụ maka na e boro ibu karịrị ya. Nke a butere ọnwụ mmadụ otu narị. 5. Ndị Inginia kwesiri ịnwale ma ụlọ ahụ o siri ike. Ede kwuru na ihe mere ndị inginịa na-enyocha ụlọ imata nke siri ike na nke ga-ada ada ji aghọ aghụghọ bụ maka nrụrụaka. 6.Ndị mmadụ na kachị ntị biri n'ụlọ na-achọ ịda ada Kamgbe ụlọ a dara ọhụrụ na Lagos dachara, akụkọ pụtara n'akụkụ gọọmenti Lagos na-ekwu na adọrọ ndị bi n'ụlọ ahụ aka na ntị n'afọ 2017. Mana agbanyeghi nke a ndị mmadụ ka na-ebi na ya. Felicia Agubata bụ inginịa kwuru na ihe mere ndị mmadụ ji leghara iwu mmachi gọọmentị Lagọs nyere gbasara ụlọ a dara ọhụrụ bụ na ha ejighi ndị uweojii bịa dọọ ha aka na ntị. Ka ụbọchị abụọ gachara ụlọ ahụ ji daa, ụlọọrụ LSBCA ebidola kụriwe ụlọ ndị dara nwalee ikwụsi ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-51798519,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51798519,Female Pilot: O nweghị ihe ọzọ m kaara ime karịa ịnya ụgbọelụ,Ngozi Idigbe bụ nwaada Igbo si Ilaa na Delta Steeti bụ onye guru soshịọlọji na mahadum dị na Naijirịa.,"Akụkọ dị na ndu nwaagbọghọ a bụ na ọ mechere ga mụọ ka esị anya ụgbọelụ ndị njem. Ka ọ dị taa Ngozi nwere ike ịbụ onye mbụ bụ nwaanyị na anya ụgbọelụ na mpaghara Illah. Lee ka o siri malite. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Vining Ogu na Adline Okere Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-43288395,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43288395,Arsene Wenger: Ọ ga-anọ ka ọ ga-ala?,"Onyenchịkwa otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger ekwetela na ha agaghị enwe ohere ibu ndị nke anọ na 'Premiership' n'afọ a ka ndị Brighton, jiri ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha n'ubọchị anọ n'ọnwa Maachị 2018.","Arsene Wenger achịala otu Arsenal kemgbe afọ 1996 Arsenal nọ n'ogo 6 dịka Tottenham Hotspur nọ n'ogo 4 ji akara iri na atọ aga ha. Ha agaghị esi Champions League afọ n'abịa n'imi ma ọ bụrụ na ha erughi ogo nke anọ na tebulu ""Premiership"" afọ a. Ha na AC Milan ga-ezute n'agba egwuruegwu 16 nke Uefa Europa League nke afọ a. Ebe Arsenal nọ ugbua na-ewe ndị na-akwado ha iwe. Na Naịjirịa, ndị a ma ama na-akwado Arsenal na ekwu ka a chụọ Arsene Wenger bụ onye nchịkwa ha. Mmadụ dịka Rauf Aregbesola bụ gọvanọ nke Oshun steeti kwuru na Wenger kwesiri itinye akwụkwọ arụkwaghị m. Banky W bụ onye oti egwu tinyekwara ọnụ n'okwu a. O kwuru na Wenger chọrọ ịnwụ n'ọrụ dịka onye nchịkwa Arsenal jiri ya maa atụ dịka onye chịburu Zibabwe bụ Mugabe. Onye egwu Patoranking agwala BBC Igbo n'oge agbara ya ajụjụ ọnụ na naanị ihe mwute ya nwere na ndụ ya bụ oge ya na-etufu ikiri egwu bọọlụ ndị Arsenal ma emesịa ha gbawa ya obi. Patoranking bụ ọkụegwu amama n'ala Naijiria Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45457784,https://www.bbc.com/igbo/45457784,Naịjirịa ga-azụta ihe eji enyocha ala maka alaọmajiji,Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ego ruru nde dọla 50 a ga-eji ịzụta ngwọọrụ ga-enyere ha aka inyocha mara ihe na-eme n'ime ala nakwa ileta alaọmajijiji.,"Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka igwu ala a na-akpọ Nigerian Geological Survey Agency na bekee bụ Alex Nwegbu kwuru nke a n'Abuja ka ndị mmadụ kwuchara n'ala mara jiji n'Abuja ụnyaahụ. Nwegbu bụ onye tinyere ọnụ n'okwu alaọmajijiji ahụ kwuru ka ụjọ ghara ịtụ ndị mmadụ na o nweghi ihe na-eme. O kwuru ka alaọmajijiji ahụ mere na Mpape ghara ịmapụ ndị mmadụ obi maka na ndị ọrụ ya amalitela inyocha ebe ahụ ozugbo. Nwegbu kọwara na ụdị ịma jijiji a emela na mba ndị ọzọ dịka Gana, Gini, Laiberia, Kameruun na ebe ndị ọzọ. Mana ndị ọrụ ha ne-eme nyocha tọrọ atọ banyere ya bụ ihe n'ebe o mere iji mata ihe kpatara ya na ihe a ga-eme gbasara ya. Cheta na alaọmara jiji mere n'isi ụtụtụ ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2018 mana omebighị ihe ahụrụ anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43780045,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43780045,"Buhari: Ị lee anya n'ọnọdụ dị oge m bịara, agbalikwaranụ m","Dịka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Femi Adesina si kọwa: ""Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na e lee anya n'ọnọdụ ọchịchị ya kwudoro n'ala anyị, na enweghị ego e dowere, e mefuchara akụnaụba anyị, ọ gbaliịkwaranụ.""","Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Adesina sị na Buhari kwuru nke a na Londọn oge ọ nabatara otu ndị nkwado ya nọ na mba ofesi nke a kpọrọ,""Buhari Diaspora Support Organization' na bekee nke onye ndu ha bụ Charles Efe Sylvester. Buhari kwụrụ n'ọbụ ndị ajọ mmadụ kwariri akụ ala Najiria ma mee ka ndị obodo anyị daa ogbenye. Mana okwu a Buhari kwuru kpara ọtụtụ ndị Naijiria iwe nke ha gosiri na sochal midia: End of Twitter post, 1 Onyeisiala na-ekwu na ya gbalịrị, mana mmadụ a na-elele onwe ya ule? O mezuru nkwa ya na otu pati ya bụ APC kwere ndị Naijiria nke ha gbadoro ukwu were tunyere ya votu n'afọ 2015? Kedụ ihe o merela ha n'ime nkwa ndị o kwere? BBC Igbo lenyere anya n'asaa n'ime nkwa o kwere iji tulee ndị o mere na ndị o meghị: I. Ibuso mmerụaka agha Ihe o mere: EFCC napụtara ọtụtụ mmadụ e boro ebubo mmerụaka nnukwu ego na ụlọ mana o nwebeghị onye ụlọikpe mara ikpe maka mmerụka. Onyeisiala na nzukọ ndị isi otu APC mere ụbọchị Monde ebe ọ nọ kwupụta na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019 N'aka nke ọzọ, ndị pati ndị ọzọ na-ebo Buhari ebubo na ọ bụ sọsọ ndị esonyeghị na pati ya ka a na-anwụchi maka mmerụaka. 2. Ibuso Boko Haram agha iji nwe ezi nchekwa O belatara mkpamkpa Boko Haram ma nata ha obodo ndị ha kpaara dịka nke ha. N'aka nke ọzọ, nchekwa obodo ka na akpụ afọ n'ala n'ihi na ndị Fulani na-achị ehi egbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgbaghara dị na-etiti ha na ndị ọrụugbo. 3. Inye ọrụ dị 720,00 kwa afọ Ihe o mere: Kama inye ọrụ dịka Buhari siri kwe na nkwa ma rotekwara ndị mmadụ oge ọ biara na Legos nsonso, a chụrụ mmadụ ruru nde anọ n'ọrụ. 4. Imachi ndị ọrụ gọọmenti ịga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa Ihe o mere: Buhari amachighị ya dịka osi kwe na-nkwa, kama, ya onwe, na nwa ya nwoke bụ Yusuf gara mba ofesi maka ịnata ọgwụgwụ. 5. Otu nri n'ụbọchị maka ụmụaka Prịmarị nke gọọmentị Ihe o mere: E bidola atụmatụ a na nanị steeti iri na anọ: Anambara, Enugwu, Oyo, Osun, Ogun, Ebonyi, Zamfara, Delta, Abia, Benue, Plateau, Bauchi, Kadụna na Taraba. Mana ụfọdụ ndị ọrụ obodo kwụụru onwe ha sị na N70.00 maka otu nrị anaghị enye nri nwere isi. 6. Ịrụ mahadum nka nna ụzụ isii Ihe o mere: A rụbeghị ọbụladi otu. 7. Ime ọkụ latrik ka ọ gbalite rue 20,000 megawat n'afọ anọ Nke a bụ maka iji mee ka ọkụ na-adị mgbe niile. Ihe o mere: Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Babatiunde Fashola siri kwuo,Naijiria enwetarula 7000 megawat. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 47819928,https://www.bbc.com/igbo/47819928,Father Clement Ugwu: Anyị ejidela ndị ahụ gburu ụkọchukwu n'Enugwu - Ndị uweojii,Ndị uweojii na steeti Enugwu ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu e gburu otu ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu bụ Rev. Fada Clement Rapụlụchukwu Ugwu na nso a.,"Ụmụnwaanyị tọgbọrọ n'ihu ụlọụka na-eru uju Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu n'ozi o zipụrụ ọhanaeze nyere aha ndị a dịka, Sunday Chibuko, bụ onye si Ụmụnna Ndịagụ nke dị n'Okpuru Ọchịchị Ezeagụ,ma bụrụkwa onye gbara afọ 32, nakwa Benjamin Osogwu onye gbara afọ 28, onye Obollo Eke nke dị n'Okpuru Ọchịchị Udenu nke steeti ahụ. Ọ kọwara na anwụchiri ndị agamevu a na-abalị 28 nke ọnwa Maachị, 2019, na-ebe nzuzo ha dị n'ogbe Area 1 Garki, Abuja, site n'usoro nchọpụta tara ọchịchị nke ndị uweojii. O kwukwara na ndị a ana-enyo enyo ka ọdị ugwu a na-enyere ndị uweojii aka na mbọ ha na-agba ịnwụchikwa ndị ọzọ, bụ ndị amaghị ebe ha gbagara ugbu a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48524330,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48524330,Jane Ada: Eji m ịkpụ arụsị Ndigbo egosi ụwa njirimara Ndigbo,Jane Ada bụ onye e ji ihe osise na ọkpụkpụ mara kwuru na ọ bụ site n'ikpụ ihe ka o ji akọwapụta ụfọdụ chi eji mara ndị Igbo.,"Jane gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'Enugwu tupu ọ gaa mba Amerịka na-arụ ọrụ kwuru na ọ maghi mgbe nke ji malite kama na ọ bụ Chineke nyere ya onyinye pụrụiche a. Arụsị ndị ọ kpụrụla gụnyere Amadioha na Ala,arụsị abụọ a ma ama n'ala Igbo. Gee ntị nụrụ ma etu o siri mee nke nakwa ebumnuche ya gbasara omenaala na asụsụ Igbo. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50269087,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50269087,Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye,Obi Emelonye bụ onye ntuziaka n'emume ihe nkiri Nollywood kọwara etu o si malite nakwa aghụghọ ndị mmadụ ghọrọ ya n'oge ahụ.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Emelonye sị na ọ bụ ọkaiwu na mba ofesi mana ọ hapụrụ ya banye n'ime ihe nkiri. Ọ sị na mgbe ọ lọtara n'afọ 2000 ka o bido ime ihe nkiri na Naịjirịa na a ghọrọ ya aghụghọ nke mere o ji laghachị ala Bekee gaa mụọ etu e si atụziaka n'ime ihe nkiri. Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ na ""ọ bụ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ"" n'ihe ọbụla mmadụ na-achọ ime na ndụ ya. Kirie ihe onyonyo ya n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44129845,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44129845,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: 'Gọọmentị gbakọtara anyị azụ' - Nne Leah Sharibu,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,"Ndị Boko Haram gara ụlọakwụkwọ Dapchi na Febụwarị afọ a Nne Leah Sharibu, bụ nwata akwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ na Dapchi ma jụ ịhapụ maka na ọ bụ onye ụka Kraịst, ekwuola na ndị gọọmentị gbakọtara ya azụ. Nwaanyị a kwuru sị ""naanị ndị otu nzukọ Kraịst na-abịa ileta anyị. Enweghị onye si gọọmentị. Anyị nọọrọ onwe anyị."" Ebe ọzọ na Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na atọrọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ na mpaghara Kaduna steeti. Ndị uweojii kwuru na ọ bụghị eziokwu na atọrọla ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị njem a si kwuo, mana enweela ndị atọrọla n'akụkụ ebe ahụ na nso nso a. Na mba ofesi, A tụọla nwoke dị afọ iri abụọ na isii nga mkpụrụ ọka afọ narị abụọ na iri ise na Saụt Afrịka. Ikpe mara nwoke a bụ Shadrax Xidada Chauke maka ebubo mwakpo n'ike iri abụọ na atọ na ịnwa igbu mmadụ ugboro abụọ nakwa izu ohi na ịtọ mmadụ. N'egwuregwu, Naịjirịa na mba Congo, England na Czech tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru isonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ. Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti. Cheta na ndị NFF na onye nchịkọta otu Naịjirịa bụ Gernot Rohr wepụtara aha mmadụ atọ ga-eso asọ mpi a na Rọshịa. Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Patrick Utomi gwara BBC Igbo ihe atọ dịkarịchara mkpa ọ chọrọ imezu ma ọ bụrụ gọvanọ na Delta steeti. ‘Ihe adịghị aga ọfụma na Delta steeti’-Pat Utomi" egwuregwu-44263748,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44263748,Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Champịọns League nke abalị a,Ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya n'ụwa niile na-atụ anya oke ihe ga-eme n'abalịa dịka Liverpool ga-ezute Real Madrid.,"Liverpool ga-ezute Real Madrid Liverpool na Real Madrid bụ otu abụọ tozuruoke ịgba asọmpi nke ikpeazụ, bụ nke ga-adị n'abalị a. Klopp na Zidane Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado otu n'ime egwuregwu abụọ ndị a ekwuola obị ha gbasara asọmpi. Ha mere nke a site n'akara twitter ha dị icheiche. Gụrụ ihe ụfọdụ ha kwuru;" media-43464988,https://www.bbc.com/igbo/media-43464988,'Obi Paul Pogba adịghị ụtọ na Man U' - Deschamps,"Onyenkuzi otu egwuregwu bọọlụ ala France bụ Didier Deschamps ekwuola na Paul Pogba, onye egwuregwu Manchester United anaghị enwe obi aṅụrị makana onye nkuzi ya bụ Jose Mourinho anaghị etinye ya n'egwuregwu.","Paul Pogba gbara sọọsọ ugboro iri abụọ na asaa n'afọ a. Mana n'afọ garaaga ọ gbara ugboro iri ise na otu N'asọmpị ole na ole gara aga, Pogba bụ onye ala France nọ n'elu oche mana ọ ga-eso n'asọmpị enyi na enyi ala ya na Columbia na Russia. Deschamps kwuru na ya amaghị ihe mere ka Mourinho kwụsị ịtịnye Pogba na bọọlụ. Deschamps kwukwara na ya nwere olileanya na Pogba nwere ohere ime ihe ga-atụ n'anya ma kwukwa na okwu ka na-abịa maka ihe a na-eme Pogba. Kenneth Umerie bụ onye egwuregwu bọọlụ na-amasị gwara BBC Igbo na Paul Pogba anaghị agba bọọlụ ka ndị otu ha sị chọ ugbua. Cheta na Man U ji nde naira iri asatọ na itoolu nwere zụọ Pogba n'afọ 2016. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50514450,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514450,Ọgba mbọ: Onye ọkaiwu na-ere ọkpa,Loveth Ifunanya Chinyere bụ ọkaiwu na-eme ọfụma ọrụ kọwara ihe mere o ji hapụ ọrụ ya bido ire ọkpa.,Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe onye dọkịta chọpụtara otu ọrịa n'ahụ nwa ya nwoke mere o ji kwụsị ọrụ iji nwee ohere ileta nwa ya anya. Loveth sị na kama ọ ga-anọ na nkịtị na o bidoro na-esi nakwa na-ere ọkpa n'ụzọ pụrụiche nke mere ka amara ọkpa ya na Legọs. Akụkọ ihe ndị ọzọ ọ gabigara dị n'ihe onyonyo a. Ọ ga-akpalite mmụọ gị ma mekwa ka ọkpa ya gụwa gị agụ. Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbahuru Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-44670374,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44670374,Lionel Messi na Cristiano Ronaldo 'akwakọrọla pụọ' n'asọmpi Iko Mbaụwa,Akụkọ ndị dị mkpa n ' ututu a,"N'egwuregwu, Messi na Ronaldo apụọla n'Iko Mbaụwa A mabeghị ma Ronaldo ọ ga-enwe ohere ịgbara Pọtugal boolu n'ọdịnihu N'egwuruegwu Lionel Messi na ogbo ya n'egwubọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na ndị otu ha akwakọrọla ngwongwo ha pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa dịka Fransị gbara Argentina ọkpụ anọ asatara atọ. Uruguay gbakwara Portugal ọkpụ abụọ asatara otu. Sinetọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti akatọọla bọgeti 2018 Uwajumogu gwara ndị nta akụkọ na ụfọdụ n'ime ha ahụghị bọgeti tupu e binyeaka na ya. Senatọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti bụ Benjamin Uwajumogu, egosila iwe ya maka ọtụtụ ihe o kwuru ebechapụrụ na bọjeti nke 2018. O kwuru na-ebechapụrụ ego edepụtara maka nhazi ọdọ ugbọelu dị na Akanu Ibiam nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ndị Igbo. Ụfọdụ ndị otu egwuregwu Nollywood akatọọla Gọvanọ Ambode Gọvanọ Ambode gara na-ebe ihe mberede okporoụzọ a mere ụbọchị tọzde. Ụfọdụ ndị egwuruegwu Nollywood ekwuola na achọghị nani ekpere na aka na-achị Legọsị steeti bụ Akinwunmi Ambode. Ha kwuru na ihe ha chọrọ bụ ịkwusị ndị ọkwọ ụgbọala bu mmanu ụgbọala ịgba mgbe ndị mmadụ juputere n'ụzọ. Ha sara Ambode asisa a ka o deputechara n'akara instagram ya etu obi si gbawa ya maka mberede okporo ụzọ lara ụgbọala iri ise na ano niyi ma gbuo mmadụ itoolu n'ụbochị tọzde gara aga. N'akụkọ mba ofesi Ndị nchekwa kwụ chịm n'akụkụ ebe ndị a na-eme mbinyeaka na Mexico A ga-ebido mbinye aka n'akwụkwọ ị chọta onye ga-anọ n'ọkwa onyeisiala, ndị omeiwu nakwa okpuru ọchịchị na mba Mexico . Cheta na-enwere ezigbo mwakpo mgbe a na-akwado mbinyeaka a ga-eme taa. Egbuola ihe ruru mmadụ otu nari na iri atọ kamgbe e bidoro ya bụ mwakpo. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Onye eboro ebubo" afirika-51425003,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51425003,"Simon Odo: 'Abụ m Eze Ekwensu, Ekwensu bụ nna m'",Simon Odo na-aza Eze Ekwensu ma sịkwa na o bụ Ekwensu bụ nna ya.,Ọ sị na njem ya na ịgba afa na-ịrụ ọrụ dịka dibia malitere oge ọ bụ otoroọbịa. Ọ kọwakwara etu o siri nụọ nwaanyị iri ise na asaa ma mụọ ụmụ agụta agụta. Lee akụkọ ya lee. Ndi mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara na Nnamdi Agbanelo afirika-47944822,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47944822,Nigerian police bill: Ụlọomeiwu ukwu ebinyela aka n'akwụkwọ iwu,Ụlọomeiwu e tinyela aka n'akwụkwọ,"Akụkọ kachasị Ụlọomeiwu ukwu Naịjrịa ebinyela aka n'ịkwado iwu ga-enye ohere ịwelite ọnọdụ ndị uweojii na Naịjirịa akpọrọ Police Reform Bill 2019 na Bekee. Nke a mere ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ha. Akwụkwọ iwu a akpọrọ Senate Bill 683 nwetere nkwado ndị omeiwu ka ọ gafechara ọgụgụ nke atọ. End of Twitter post, 1 Onye gụpụtara ya bụ Sinatọ Tijjanj Kaura (APC-Zamfara North) were nwete nkwado Mao Ohuabunwa (PDP-Abia North). Onyeisi ha bụ Bukola Saraki kwuru na nke a bụ mbụ a na-akpatụ iwu a aka kamgbe afọ 1943 ma kele kwa ndị kọmitti na-ahụ maka ndị uweojii dpụtara iwu a. Alan Garcia agbagbuola onwe ya Alan Garcia bụbu Onyeisiala Peru Onye bụbu onyeisiala mba Peru bụ Alan Garcia agbagbuola onwe ya oge ndị uweojii bịara ịnwụchị ya. A sị na Garcia bụ onye nwụrụ n'ụlọọgwụ riri ngarị sita n'aka ọtụ ụlọọrụ si mba Brazil, bụ nke ọ gọọrọla isi ya ọtụtụ oge. Ọ nwụrụ n'ụlọogwụ dị n'isi Obodo ha bụ Lima dịka onye na-achị ugbua abụ Martín Vizcarra kwuru. Ụlọọrụ EFCC na Malabu Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaipke D.Z Senchi nọ n'isi ya enyela ụlọọrụ EFCC ikike ịnwụchị ndị a sị na aka ha dị na nrụrụaka na ngarị gbasara mmanụ agbidi Malabu. Ndị a gụnyere Minista na-ahụbu maka mmanụ agbidi n'oge mbụ bụ Dan Etete, Mohammed Adoke bụbu Minista ikpe nkwụmọtọ na ọkaikpe ukwu Naịjirịa. Ndị ọzọ ewepụtara aha ha dịka ndị buru awoo a na-achọachọ bụ Raph Wetzels, Casula Roberto, Pujato Stefeno, nakwa Burrato Sebastiano. Ndị kwesiri iwuchi n'ihu ụlọikpe a taa ụbọchị iri na asaa ọnwa Epreelu mana ha a bịaghị nke mere ọkaikpe Senchi ji nye ihu ka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nwụchie ha ebe ọbụla ahụrụ ha. Ndị uweojii na ka esị eso ha Yomi Shogunle bin talk say #EndSARS no be serious mata Abayomi Shogunle agwaala ndị mmadụ ha hapụ ị sụ sụprị-sụprị ma ndị uweojii kwụsị ha iji gbalahu mmegbu. Ọ bụ n'akara Twitter ya ka o si zipu ozi a na-ekwu na asụsụ Bekee ekebiri bụ ""Pidgin"" ka mma. Ndị mmadụ amalitela iji ya eme akaje maka ya bụ okwu. ""Onye azọpụtara"" Ọ bụ aha ọhụrụ ndị ọrụ mmanụ agbidi na mba Thailand bara nwa nkịta ha si n'ime osimiri zọpụta. Ndị ọrụ ahụ sị na ha hụrụ ya ebe ọ na-agba mgba ndụ ya tupu ha zọpụta ya gụgharịa ya aha. Ndị uweojii na ndị ha nwụchịrị Ndị uweojii na Delta steeti sị na ha akparala mmadụ ise ha na-ebo ebubo na ha wakporo ụlọ ọrụ ha n'Asaba. ASP Chukes Oresewezie bụ onye binyere aka n'akwukwọ mgbasaozi sị na ndị a ha ji, ha nwetere mma na egbe n'aka ha bụ ndi Ipob. Mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị na ibepụ onye ọchị ehi isi n'Ebonyi steeti nọzị n'aka ndị uweojii. N'uche ndị uweojii, ọ bụ mmegwara mwakpo ndị ọchị ehi wakporo obodo Onunwakpu n'afọ gara aga butere nke a. N'egwuregwu, Dịka Naịjirịa na-akwado Asọmpị mba Afịrịka, Emmanuel Amunike ekwuola na ya bu njem agaghị adị mfe. Amunike sị na otu egwuregwu ụfọdụ mba aha ha adịghị ada ụda ọfụma n'egwuregwu bọọlụ ga-ejikere iwunyere mba dịka Naịjirịa aja na garri." egwuregwu-51910069,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51910069,Football Gossip: Mbappe a na-achọ ụzọ ọpụpụ na PSG?,Kylian Mbappe na-agbara mba Fransị nakwa otu PSG bọolụ ahaziewela ọdịnihu ya n'egwuregwu bọọlụ a.,"Akụkọ pụtara na-akọwa na ọchọrọ ka-etinye ohere n'ime akụkwọ ọrụ ya ga-ekwe ya hapụ PSG gaa otu Real Madrid maọbụ otu Yurop ọbụla masịrị ya n'ọdịnihu. Amabeghi ma anya otu Real Madrid ma otu ọbụla a dị n'ebe Mbappe dị afọ 21 nọ. Gịnị bụ ọdịnịhu Neymar n'egwuregwu bọọlụ Kepu kepu na-efegharị na-ekwu na anya Neymar dị n'ebe otu Barcelona nọ. Neymar da Silva Santos bụ ọgba bọọlụ a ma ama na-atụ anya ịlaghachi n'otu bọọlụ Barcelona nke mba Spen. Ugbua, ọ na-agbara otu PSG nke mba Fransị bọọlụ mana o nwereike ịchabi ụgwọ ọrụ ya n'ọkara ma o kpebie ịga Barcelona. N'otu aka ahụ Mesut Ozil ọgba bọọlụ mba Jamini ga-anọzi na afọ ọhụrụ otu ọhụrụ dịka otu Fenerbahce na otu ya bụ Arsenal na-ahazi akwụkwọ a ga-eji zụ ya n'afọ bọọlụ ọzọ na-abịa. Otu Tottenham na-ana otu Newcastle nde pounds iri na abụọ na ọma ise maọbụrụ na ha chọrọ ịkpọpụta Mauricio Pochettinho dịka onye nchịkọta ha n'ọnwa Mee a. Ihe ịtụ anya dị na ya bụ na ọnwa Mee gacha, Tottenham nwereike ịkpọrọ Pochettinho n'efu. Ọzọ, otu Real Madrid adịla nkwadobe ịkpọpụta ego ole ha chọrọ ịzụ Paul Pogba nke Fransị na Manchester United ka ọ bịa sonye ha. Otu Liverpool, Intermilan, Juventus, Chelsea nakwa Arsenal so na otu ndị hiri asaa n'anya achọ ndị ọgba bọọlụ ọhụrụ ha ga-azụta. A ga-egbubi ego Neymar na-eri ma ọ bụrụ na ọ ga-alaghachi Barcelona Neymar Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Neymar ga-anara ụgwọọnwa e wepụrụ ihe ruru nde paụnd 26 ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịlaghachị Barcelona. O teela akụkọ na-efegharị na Neymar dị afọ 28 ugbua chọrọ isi Paris Saint Germain (PSG) pụọ ma laghachi ebe ọ gbaburu mbu. Cheta na Neymar gbaara Barcelona bọọlụ site n'afọ 2013 ruo afọ 2017 tupu o si ebe ahụ gafee PSG. James Rodriguez ọ ga-agafe MLS? James Rodrigues Akụkọ na-efegharị na-akọwa na David Beckham bụ onye nwe otu egwuregwu Inter Miami dị na MLS na mba Amerịka na-atụ alo etu ọ ga-esi zụta James Rodriguez. Akụkọ ahụ kwuru na Beckham bụbu ọgbabọọlụ na onwe ya, na ndị Real Madrid bụ ebe Rodriguez na-agba, akpaala maka ịzụrụ ya. Mara na kemgbe ka kepu kepu na-apụta maka etu Rodriguez dị afọ 28 nwereike iji si na Madrid pụọ na ngwụcha afọ a. Premier League a ga-ebido ole mgbe? Onwebeghi onye ma mgbe asọmpi 'English Premier League' ga-amalite ọzọ Akụkọ na-akọwa na ụfọdụ ndị klọb agwala ndị ọgbabọọlụ kee nkwụcha n'ihi na ha nwereike imalite izukọ maka nkwado ịbịaghachị ọrụ. Ha na-atụ anya imalite ya bụ mbido nkwado n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee nke afọ 2020 a. Manchester City a ga-azụ Aubameyang? Akụkọ kwubukwara na Pierre-Emerick Aubameyang nwere ike ịga Real Madrid Kepu kepu si n'ụwa egwuregwu apụta na-akọwa na Manchester City esonyela n'otu egwuregwu ndị chọrọ ka Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal gbaara ha bọọlụ. Akụkọ a kwukwara na Barcelona, Inter Milan na Real Madrid chọkwara ịzụrụ nwaamadi a dị afọ 30. Mara na ihe jikọrọ ya na Arsenal, ya bụ nkwekọrịta dị n'etiti ha abụọ, ga-agwụ n'afọ 2021. Manchester United achọghịzị Rodriguez James Rodrigues Kepu kepu ọzọkwa na-eru anyị ntị na-akọwa na Ike agwụla Manchester United ịchụgharị James Rodriguez. Rodriguez dị afọ 28 na-agbara Real Madrid bọọlụ ugbua. Nkwekọrịta dị n'etiti ya na Real Madrid ga-akwụsị n'afọ 2021. Mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị Arsenal na Rodriguez ka okwu nwere ike ịdabara. Onye ka Mourinho bu n'uche ịzụ? Jose Mourinho Akụkọ pụtara na-akọwa na Jose Mourinho bụ onye nchịkọta otu Tottenham na-atụ anya ịzụta Raul Jimenez dị afọ 28. Jimenez bụ onye mba Meziko na-agbara Wolverhampton bọọlụ. Ọ bụ otu onye Mourinho na-enwe olileanya iji anọchị anya Harry Kane ma ọ bụrụ na kepu kepu na ọ ga-apụ bịa na mmezu. Juventus chọrọ ịzụ Kane dịka Real Madrid chọrọ ire Bale Harry Kane nwere ike ị hapụ Tottenham Dịka akụkọ ahụ si kwuo, etu Kane dị afọ 26 si agba bọọlụ na-amasị Juventus, ""ọ kabeghi nka, ọ bụ ezigbo onye ndu, ya na Cristiano Ronaldo nọkọọ ọ ga-adaba ọfụma"". N'otu aka ahụ, Christian Vieri gbabuuru mba Itali bọọlụ kwukwara na ọ ma na ịgba bọọlụ na mba Itali ga-adị Kane mma n'ahụ. Harry Kane na-aṅụrị maka mmeri goolu na asọmpị Vieri kwuru sị na ọ ma na ""La Liga maọbụ Serie A ga-adịrị Kane mma ma ọ bụrụ na ọ chọọ isi Tottenham apụ"". Madrid na-achọ ire Bale Akụkọ si mba Spen apụta na-akowa na Real Madrid na-achọ ire ndị egwu ha gụnyere Gareth Bale, James Rodriguez, Lucas Vazquez na Mariano Diaz. N'agbanyeghi na Bale dị afọ 30 achọghị akụkọ a na-ekwu na ọ dịka ọ gaghị enweta ohere ịnọ. Mara na ọ dị ka Rodriguez dị afọ 28 na-achọ ịpụ, n'ihi na onye na-asụrụ ya ụzọ bụ Jorge Mendes ji tọọchị na-agba ọkụ ịhụ ndị ọ na-agụ agụụ ịzụta ya. Giroud ọ ga-ahapụ Chelsea? Akụkọ na-efegharịkwa na Olivier Giroud na-agbara Chelsea bọọlụ ga-efere ha aka mgbe asọmpi bọọlụ malitere ọzọ. Akụkọ ahụ kwuru na Giroud dị afọ 33 na otu egwuregwu Inter Milan ekwekọrịtala na ọ ga-agbara ha bọọlụ mgbe nkwekọrịta ya na Chelsea ga-agwụ n'afọ a. O kwukwara na ya na Inter Milan bụ ebe Antonio Conte chịkọtaburu Chelsea na-achịkọta ugbua, na-achọ inwe nkwekọrịta ga-eme ka ọ gbaara ha afọ abụọ ma nwekwaa ike ịtụkwasị ya nke atọ ma ọ chọọ. Marakwa na akụkọ pụtara na mbido ọnwa a na Chelsea na-achọ ịdọtikwu nkwekọrịta ha na Giroud nwere, ka o nwee ike nọtukwuo opekatampe otu afọ ọzọ. Nkwekọrịta Pierre-Emerick Aubameyang na ndị Arsenal ga-akwụsị n'afọ 2021 N'asịrị gbakaa ute egwuregwu nke taa, Ọ dịka Real Madrid ana arọ Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal anya, dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo. Aka nchawa Aubameyang pụtara ihe kemgbe o sị Borussia Dortmund banye Arsenal n'ọnwa Jenụwari afọ 2018. Mana ugbua, aha ya bụzi onyemaechi maka na nkwekọrịta ya na ndị Arsenal ga-ebi n'afọ ọzọ. Ka ọ dị ugbua, Madrid ekwubeghị uche ha gbasara ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ, mana ya bụ eziokwu ga-apụta ihe mgbe adịghị anya maka na ha chọrọ onye ọkpa ya dị nkọ ka nke Aubameyang. Ọnwa Camavinga ọ chakeela? Eduardo Camavinga Ugo Eduardo Camavinga, nwaafọ mba Kongo, nke na-agbara otu egwu bọọlụ Rennes nke mba Frans achakewala o. Camavinga malitere ịgbara ndị Rennes kamgbe ọ dị afọ iri na ise Onye nkuzi ndi Rennes bụ Julien Stephen kwuru na n'ezie ya bụ nwaadị chị ọkụ n'ọkpa nke bụ na ọnwere ike ịgbanwuru ndị Real Madrid, ""mana ọ fọrọ nwa jaị ka ugo ya chakechaa. Ya nwetukwuo ndidi ihe dịka otu afọ"". Ọtụtụ otu egwu bọọlụ nwere agba dịka Real Madrid amalitelarị ịrọ ya bụ nwa amadi na-agba etiti anya maka ịzụrụ ya. Onye nkuzi ya ugbua bụ Stephen sị na Camavinga etoruola ihe eji dimkpa eme n'egwu bọọlụ. Sadio Mane ọ ga-erita nturuugo Ballon d'Or na-abịanụ? E nyere Sadio Mane asambodo dịka otu n'ime ndị kacha agba bọọlụ n'ụwa n'afo 2019 Sadio Mane turu ọnụ na mba ya bụ Senegal na ya ga-ebutelata nturuugo Ballon d'Or nye ha n'aka. Nke a mere ka ndị mmadụ malite ikwu otu ya bụ echiche nwere ike iji puta ihe. Ụfọdụ na-ekwu na ihe ga-eme ka ya bụ nturuugo ruo Mane aka bụ na ọ ga-esi na Liverpool gaa Barcelona maọbụ Real Madrid. Gịnị mere ha ji eche otu a? Sadio Mane na ndị Liverpool napụrụ Messi na ndị Barcelona ọnụ n'ara n'asọmpi 'Champions League' nke 2019 Echiche ha gbadoro ụkwụ na Messi na Ronaldo ritere ya bụ nturuugo na mbụ na-agba na Spen. Ya bụ, ha na-eche na ịgbara Barcelona maọbụ Real Madrid ga-enye Mane ezigbo ohere irite ya bụ nturuugo. Mana, John Aldridge bụbu ọgbaa bọọlụ ndị Liverpool na-akọwa na Mane nwere ohere na Liverpool ịnweta ya bụ nturuugo karịa ebe ọzọ. Dịka Aldridge kwuru, nke mbụ bụ na ọ tụọ ọkpa na Barcelona, ya na Messi ga-achịpụgodu ya ebe ahụ tupu ọ nwete onwe ya. Mane, gbara afọ 28 si Southampton bata Liverpool na 2016. Kamgbe ahụ, o nyela goolu iri 77 n'asọmpi 161. Liverpool ji ya n'ọrụ rụọ afọ 2023. Chelsea chọrọ ire Ngolo Kante Ngolo Kante Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea dị njikere ire nwaafọ mba France na-agbara ha bọọlụ bụ N'Golo Kante ma ọ bụrụ na e kwee ya ezi ọnụahịa. Kante di afọ 29 ugbua mana Chelsea echeghi na ohere ka dịịrị ya ịgbara ha bọọlụ n'ọdịnihu dịka ha emepeela ụzọ ịnabata ndị chọrọ ịzụ ya. Real Madrid na Paris Saint-Germain etinyela uche ha n'ịzụ Kante bụ onye ka nwere ohere ịgbara Chelsea bọọlụ ruo afọ 2023. Ọtụtụ ndị nkwado Chelsea na-ahụta N'Golo Kante dịka 'ụdọ' na-ekechiri ha ebe etiti ma a bịa n'asọmpi. Messi agọọla na onweghi ihe jịkọrọ ya na Inter Milan Lionel Messi Nwafọ Ajentina na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Lionel Messi agọọla na onweghi ihe jikọtara ya na otu egwuregwu Inter Milan dị n'Itali. Messi bụ onye dị afọ 32 kwuru nke a n'akara Instagram ya, iji katọọ akụkọ na-efegharị nke sị na ndị Inter Milan chọrọ ịzụ ya. Ọtụtụ ndị hụrụ egwu bọọlụ n'anya sị na Messi bụ ọkacha agba bọọlụ n'ụwa ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ ogbo ya Cristiano Ronaldo. Countinho na-achọ ịlọghachi na 'Premier League' Philippe Coutinho Nwafọ mba Brazil na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Philippe Countinho na-achọsike ịlọghachị na Premier League. Dịka ọ dị ugbua Chelsea na Barcelona na-enwe mkparịtaụka n'isi Countinho, ka a mara ma ọ ga-agafe Chelsea. N'otu aka ahụ obi siri Chelsea ike na ha ga-amabute Countinho n'ụgwọ site n'aka Barcelona bụ onye ha chụwara kamgbe Eden Hazard pụrụ. Countinho nọ n'aka Bayern ugbua bụ ebe Barcelona zigara na mgbazinye, mana ọ dịka Bayern achọghị ịzụ ya kpam kpam. Nwaamadị a bụ odogwu oge ọ na-agbara ndị Liverpool, mana kamgbe ọ pụrụ, onwetechabeghi onwe ya nke ọma. Manchester United na Juventus na-azọ onye ga-azụ James Rodriguez James Rodrigues Man United, Juventus na Napoli so na ndị na-agba mgba onye ga-amabute James Rodriguez site n'aka ndị Real Madrid. Nwaafọ Kolombia a anaghị eme nke ọma na Real Madrid ugbua kamgbe o si Bayern Munich lọghachịta. Akụkọ kwuru na Rodriguez nwereike ibelata ego ole a ga-akwụ ya iji mee ka ọ pụọ maka oge ya na Madrid ga-agwụ na 2021. Coronavirus ga-esi nyere Man United aka ịzụta ndị egwu - Solksjaer Ole Gunnar Solksjaer, onye nkuzi ndị Manchester United Onye nchịkọta Manchester United bụ Ole Gunnar Solksjaer sị na obi siri ya ike na ha ga-eji ohere mkpamkpa ọrịa Coronavirus a zụta ndị ọgba bọọlụ dị ha n'obi. O kwenyere na ụfọdụ otu egwuregwu ga-achọ ikpofu ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ n'ihi ụkọ ego dị ugbua bụ nke ọ sị ga-enyere Man United aka. Na mkparịtaụka ya na ndị 'Sky Sports', Solsjaer kwuru na ""egwu bọọlụ ga-alọghachị n'uju ma ọrịa Covid-19 gaachaa, ma ihe kachasị mkpa bụ na anyị dị njikere mgbe ọ ga-eme"". Ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Man United na-achọ ịzụ gụnyere; Jadon Sancho nke Borussia Dortmund, Jack Grealish nke Aston Villa na Jude Bellingham. Real Madrid agbanyụọla ọkụ ịzụ Mbappe n'afọ a maka Coronavirus Kylian Mbappe Nrọ ndị Real Madrid na-arọ ịzụta Kylian Mbappe n'aka ndị Paris Saint-Germain ga-echere ruo afọ ọzọ tupu ọ na-abịa na mmezu. Nsogbu na ụkọ ego dakwasịrị ọtụtụ otu egwuregwu n'ihi Coronavirus mere ha jiri chegharịa echiche n'ịzụ nwamadị a. Real Madrid malitere atụmatụ ịzụ Mbappe kamgbe afọ ise gara aga mana otu ihe maọbụ nke ọzọ na-ama ha aka n'ihu. Atọhapụla Ronaldinho na mkpọrọ na Paraguay Ronaldinho nọrọ ụbọchị 33 na mkpọrọ tupu a tọhapụ ya Ronaldinho, onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama, enwerela onwe ya dịka a tọhapụrụ ya n'ụlọ mkpọrọ na Paraguay. E jidere Ronaldinho na nwanne ya nwoke bụ Roberto Assis n'ọnwa Maachị n'ihi ebubo na ha ji 'passport' adigboroja wee bata n'obodo ahụ. A kpụpụrụ ha ụlọikpe ma tinye ha na nga ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ha. Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ' Mana n'ụbọchị Wenezde ka ọkaikpe nyere iwu ka atọhapụ ha ka ha nọrọ n'otu ụlọ oriri na nkwari ruo mgbe ikpe ahụ ga-ebi. Ọkaikpe ahụ nyekwara iwu ka Ronaldinho na nwanne ya kwụọ puku narị dọla asatọ n'otu n'otu. Aha Ronaldinho na-ada ụda n'ụwa niile n'ihi ihe o ji ụkwụ eme n'egwuregwu bọọlụ. O ritere nturuugo onye kacha agba bọọlụ n'ụwa niile n'afọ 2004 na 2005. Ronaldinho sokwa n'otu ndị Brazil buru iko mba ụwa n'afọ 2002. Kepukepu na-efegharị bụ na Lionel Messi nwereike ịhapụ Barcelona gawa Inter Milan dịka Massimo Moratti bụbu onyeisi Inter Milan si kwuo. Moratti sị na ọ bụ ihe nwereike ime site na mgbanwe ọnọdụ ego di ugbua n'ihi ọrịa coronavirus bụ nke ga-enyere Inter Milan aka ịzụta Messi. Messi agbaarala Barcelona boolụ kamgbe ọ malitere ịgba bọọlụ na nwata rute ugbua mana uche Inter Milan adịla n'ebe ọ nọ nke ukwuu. Ha nwere olileanya na ọzụzụ Juventus zụtara Cristiano Ronaldo site Real Madrid ga-eme ka ịgbalite mmụọ Messi ịbịa Inter Milan. Manchester United na-achụsị Jadon Sancho ike ka nwa ọkụkọ Jadon Sancho Obi siri ndị Manchester United ike na ha ga-azuta nwafọ Ịngland bụ Jadon Sancho site n'aka ndị Borussia Dortmund n'oge orire na ọzụzụ ndị ọgba bọọlụ nke afọ a. Nwamadị a dọọrọ mkpụrụobi ndị Man United site n'ịgba bọọlụ nke ọma n'otu egwu Borussia Dortmund nke mere ha ji achụsi ya ike. Akụkọ kwuru na Sancho ekwetela ịgafe n'Old Trafford bụ ọgbọ egwuregwu ndị Manchester United. N'aka nke ọzọ akụkọ kwukwara na Paul Pogba chọrọ izụ onwe ya nye n'aka ndị Real Madrid. Barcelona, Real Madrid na Manchester City na-azọ onye ga-azụ Martinez Barcelona na-agbasi mbọ ike ịzụ Lautaro Martinez dị afọ 22 site na Inter Milan mana Real Madrid na Manchester City na-echere ha aka mgba. Na-agbanyeghi nke a Barcelona ka bụ ndị nwere ezigbo ohere ịzụta nwafọ Ajentina a karịa Real Madrid na Man. City. Barcelona chọrọ iji Griezman gbanwere Neymar Messi ekwuola ugboro ugboro na ọ ga-amasị ya ma Neymar lọghachite na Barcelona Otu egwuregwu Barcelona ka nwere olileanya ịzụta nwafọ Brazil bụ Neymar site n'aka ndị Paris St-Germain. Dịka Sky Sports si kwuo, ọ ga-amasị Barcelona iji Antoine Griezmann gbanwere Neymar. Cheta na Neymar gbabuuru Barcelona bọọlụ tupu ọ hapụ ha gawa PSG n'afọ 2017 n'ọnụ ego ruru nde yuro 222. Ọ bụ eziokwu na Neymar mere ọfụma oge ọ nọ na Barcelona mana ụfọdụ ndị mmadụ kwenyere na Lionel Messi enyeghi ya ezigbo ohere ka ọ chakee, nke kpatara o ji pụọ. Barcelona gbalịrị ịzụtaghachi Neymar n'afọ gara aga, mana PSG ekweghị ere ya. Haaland awụọla Manchester United n'ala Erling Haaland Erling Braut Haaland na-agbara Borussia Dortmund bọọlụ awụọla Manchester United n'ala dịka ha chọrọ ịzụrụ ya. Ọnụ na-ekwuru Haaland bụ Bernie Mandic kwuru na Haaland kwenyere na ọ ga-aka mee nke ọma na Dortmund karịa ịga ebe ọzọ. Pogba nwere olileanya ịga Real Madrid Paul Pogba Nwafọ mba France bụ Paul Pogba ka nwere ọnụnụ ọkụ n'obi ịhapụ Manchester United gawa Real Madrid. Pogba chọrọ ka ya na nwanna ya Zinedine Zidane, bụ onye nchịkọta Real Madrid rụkọọ. Oke mmerụ ahụ ekwebeghi Pogba zuru ike na Manchester United kamgbe o si Juventus gafee ebe ahụ n'afọ 2016. Ndị Chaịna ebunyela Ighalo ite ego ka ọ lọghachi Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Odion Ighalo nọzị n'etiti ịhọọ mmiri maọbụ amụma. Ọ bụ n'ihi na otu bọọlụ Shanghai Shenhua na mba Chaịna ewelitela ụgwọ izuụka ya rue £400,000. N'aka nke ọzọ, ọ ka ji otu ụkwụ nọrọ n'otu Man Utd ebe ọ gara dịka onye ọgba bọọlụ e bitere ebite Ighalo sonyere Shanghai Shenhua n'ọnwa Febụwarị afọ 2019, ebe Man Utd si hụ ya were biri ya mbimbi. Ighalo na-enwe olileanya na Man Utd ga-azụrụ zi ya dịka onye bọọlụ nke ha zuru oke mana otu Man U ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya. Ya mere ndị mmadụ na-ajụ ""Gịnị ka Ighalo ga-eme?"" Ighalo n'onwe ya ekwuputebeghi ihe ọbụla maka nke mana ka anyị na-ele anya. Barcelona nwere ike ire Griezman Ihe abụọ chere otu Barcelona n'ihu ugbua nke gụnyere - ibelata mmefu ego nakwa ikwalite otu bọọlụ ha. Nke a mere ha ji tinye Antoine Griezmann n'ahịa na ""Transfer season"" ọzọ na-abịa n'ihi na o meghi ka ha si tụọ anya mgbe ha ji ego yuro nde narị n'ọma abụọ zụta ya n'aka Athletico Madrid. Mana ha na-akwado ire ya sọọsọ yuro otu nde narị iji nwetakwa ego ha mefuru n'isi ya. Kepu kepu na-ekwu kwa na otu ndị welitere isi dịka Man United, Chelsea, Arsenal na PSG na-enyo Griezmann enyo maka ịzụta ya. Ka a na-atụ anya mara nke ga-eme n'ahịa ""Transfer"" ga-emepe n'oge na-adịghị anya. Ihe nwereike ime ka Pogba gaa Real Madrid maọbụ Juventus Akụkọ ndị akwụkwọ mgbasa ozi SUN dere na-akọwa na ha nwereike irepụ Paul Pogba n'ọnụ £100M. Nke a na abịa dịka ndị otu bọọlụ Real Madrid na Juventus na-achụsị ya bụ nwa okorobia ike. N'akụko ọzọ ndị otu Manchester united na-ajụ ese ịzụta Philippe Coutinho gbara afọ iri abụọ na asaa n'aka ndi otu Barcelona. (Mundo Deportivo) Philippe Coutinho na-agbara ndị mba Brazịl bọọlụ Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Goal na-ekwu na ndị otu Athletico Madrid na-akwado ịdọtị nkwekọrịta afọ ọrụ ha na Thomas Patey nwere ka ọ rụo afọ 2025. Ha ga-ebuli kwa ego isi ya rụo €100M. Partey bụ nwaafọ Ghana Nke a na-abịa dịka ndị Arsenal na otu Manchester United na-achọ ịzuta ya. Kepukepu na-ekwu kwa na David Alaba onye na-agbara ndị otu Bayern Munich na-atụli ma ọ ga-esi otu ya pụo dịka ndị otu Real Madrid na Barcelona na-achọ ịzụta ya (Sport Bild-in German) Alaba na-gbara ndị mba Austria bọọlụ Ndị otu egwu bọọlụ Arsenal eweela iwe dịka ha sịrị na ndị otu Barcelona na-arafụ Pierre-Emerick Aubameyang n'ọrụ ya. Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na Aubameyang chọrọ ị ga otu Barcelona (Star). Kama Aubameyang sị na obi dị ya ụtọ n'Arsenal. Akụkọ na-ekwu kwa na onye nkụzi ndị Arsenal bụ Mikel Arteta chọrọ irepụ Henrikh Mkhitaryan sị mba Armenia dịka ndị otu Roma na-agbalị ka ha zụta ya azụta na abụghị mgbazị(Express) Henrikh Mkhitaryan nọ na mgbazị n'otu Roma Onye nwe otu egwu bọolụ Chelsea bụ Roman Abramovich na-anụ ụda Coronavirus dịka ọ sepụrụ oher pawụnd abụọ na ọma. Abramovich gbara afọ iri ise na atọ bụ onye nwe otu Chelsea Kama Abrahimovich ka bụ kwa ide dịka akụ ya ka karịkwara ijeri pawụnd iri (Star). Ndị otu Aston Villa na-achụ Dion Sanderson ọsọ ụkwụ eru ala. Ha chọrọ ka ọ bụrụ onye otu ha kama Sanderson ka na-agbara ndị otu Cardiff City na mgbazị (Football Insider) Kepukepu na-ekwu kwa na anya ndị Manchester United nọ n'isi Samuel Umtiti. Umtiti na-agbara ndị mba Fransị bọọlụ Umtiti na-agbara ndị otu Barcelona na ndị mba France( Sport na Spanish). Akụkọ ga-amasị gị Gọvano Sanwo-Olu ejirila nde naira 250 tie ndị ọkụ gaasị metụtara aka n'obi" afirika-46457584,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46457584,Omeiwu Onyewinfe eferela APGA aka,"Onye na-anọchite mpaghara Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nke nta bụ Gabriel Onyewinfe agbarala APGA ụgbọ nwamkpi, ma banye PDP.",Onyeisi ụlọomeiwu bụ Yakubu Dogara gbara ama nke a oge ọ gụpụtara akwụkwọ ozi nke Onyewinfe detara n' ụbọchị Wenezde. O kwuru na ihe butere mkpebi ya bụ na 'APGA nọ na nnukwu nsogbu' kemgbe e mechara ntuliaka imeụlọ ha nke mere e jiri nwee ndị pụrụ apọ na-akpọ onwe ha 'APGA ọhụrụ.' Akụkọ ga-amasị gị: afirika-47451981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47451981,CBN Governor: Achụbeghi Emefiele n'ọrụ,"Akụkọ pụtara n'ụbọchịanọ nke ọnwa Maachị 2019, kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari chụrụ onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele n'ọrụ.","Ụfọdụ kwuru na Buhari gwara ya sị ya gaa ezumike ga-eru ọnwa atọ ebe ọ ga-esi pụọ n'ụlọakụ ahụ. Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ụlọakụ CBN iji nụ olu ha gbasara okwu a, ha kwuru na o nweghi eziokwu dị na ya. ""Achụbeghi ya n'ọrụ"" ka Isaac Okoroafor bụ onye ọrụ CBN gwara anyị. Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi Ụlọntaakụkọ Punch kwukwara na ha nụrụ kepu kepu na Emefiele ka nọ n'ụlọakụ ya chịm. Mana ụfọdụ mmadụ ekwuola na Buhari na-akpa nkata iji onye ugwu na-ekpe alakụba dochie Godwin Emefiele. Otu n'ime ha dịka @amaniro_s kwuru nke a n'akara Twitter ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49562057,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49562057,Davido ọ kụọla aka n'ụzọ ọyị ya nwaanyị o bunyere ụgbọala naira 45 million?,"Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ gbasara akụkọ na Davido na-akwado ilụ Chioma Rowland, ọyị ya nwaanyị.","Nke a na-eme ka Davido wepụtachara foto gosiri mgbe ya ndị be Chioma nọ n'elu Instagram wee dee ""First of all introduction"". End of Instagram post, 1 Nwanne Davido bụ Adewale Adeleke tinyekwara ọnụ n'okwu a. Ndị ọyị ya ndị ọzọ nakwa ndị nso nso ya kwuru ọtụtụ ihe maka ya bụ ndepụta. Etu ọ dị ugbua, amabeghị mgbe ya bụ alụm dị na nwunye ga-eme mana etu Davido depụtara maka ịkụ aka n'ụzọ o mere na-eme ka ndị mmadụ na-akwado maka igba nkwụ ha. Ha bakwara ya aha dịka #CHIVIDO2020. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47656072,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47656072,"Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga",A ga-akpọnụ nke a arụ ka arụ bikonu?,"Bishop na-achịkọta ndị ụka Katọlik n'Enugu ekwuola ka ndị ntọrị si tọrọ ụkọchukwu Clement Ugwu, naa ndị be ya ego ruru nde naira iri abụọ ma wekọrọ ego niile dị na ATM ya tupu ha egbuo ya. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru mgbe a na-eli ya." 43201141,https://www.bbc.com/igbo/43201141,"Joe Achuzia, onye agha Biafra anwụọla",Onye bụ otu onye ndị duru ndị agha Biafra n'agha Naịjiria anwụọla ka ọ gbara afọ ịrị itoolụ.,"Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 Joe Hannibal O.G. Achuzia nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị taa ebe elekere asatọ n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti n'Asaba. Diọkpara ya bụ Onyeka Achuzia gwara ndị ntaakụkọ n'Asaba na ọ bụ obi tiwara etiwa ka ha jiri agbasa ozi a. Ndị agha Biafra ""Nnam rịara ọrịa nwa ntakịrị oge tupu ọ nwuọ. Ihe a dị anyi nwute."" Achụzia so na ndị ịsị agha Biafra nụrụ ọgụ mnwere onwe n'afọ 1967. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48110208,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48110208,Zainab Aliyu: Atọghapụla nwata nwaanyị ejichiri na Sawudi Arabia,Ọ bụ onye odeakwụkwọ mịnịstrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Sulaimana Mustapha kwuru nke a.,"Zainab Habib O kwuru na ka ọ dị ugbua, a na-atụ anya na gọọomentị mba ahụ ga atọghapụ onye ọzọ eboro ya bụ ebubo bụ Ibrahim Abubakir. Cheta na anwụchiri Zainab na mba Sawudi Arabia maka ebubo na ọ tụrụ mgbere ọgwụike na mba ahụ. Onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Abike Dabiri tinyere ọnụ n'okwu a. End of Twitter post, 1 Ụfọdụ ụmụakwụkwọ mekwara ngagharịwe gbasara ọnọdụ Zainab Aliyu iji gosi na ha kwụ ya n'azụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45544742,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45544742,Technovation: Anyị meriri ka ụmụwaanyị nwee ike mụta teknụzụ,"""Onweghi onye riri nri maọbụ ṅụọ mmiri mgbe anyị na-eche ịṅụ maka ụmụaka a"".",Ihe a na ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị nwe ụmụaka Regina Paecis kwuru mgbe BBC Igbo gara leta ụmụaka ahụ dịka ha natara njem mmeri ha. Ụmụaka ahụ kwuputara ka obi siri dị ha aṅụrị n'ihi mmeri ha. media-45584731,https://www.bbc.com/igbo/media-45584731,Ị ji gọomentị ego ụtụisi?,Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụtụ isi n'ụzọ dị icheiche n'ala Naịjirịa apụtala ị kọwa etu ndị mmadụ ga-esi gbakọ ụgwọ ụtụisi.,Ha kọwakwara etu ya bụ ụtụ isi siri baa uru nakwa ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na akwụkwọ ụtụ isi gị ezughi oke. Ihe onyonyo a gosikwara ihe dị iche n'etiti onye na-eri ụgwọ ọnwa nakwa onye na-azụ ahịa nọrọ onwe ya. Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo afirika-44271147,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44271147,Mgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala,Ndị na-eme egwuregwu n'ọgbọ Okpara Square dị n'Enugwu akọwala etu mkpatị ahụ ji enyere ha aka n'ịgwọ ọrịa dị icheiche.,"BBC Igbo mere njem ebe ahụ ị maara etu ihe ji aga ma gbaa ụfọdụ ha ajụjụ ọnụ. Onye mgbasa ozi otu akpọrọ Coal City Fitness Exclusive bụ Nwamazi Obiora Okereke kwuru na ọ ruela ọtụtụ afọ ha maltere egwurewgu a ebe a. Onye ọzọ bụ Lolo Kate Ezenagu kwuru na ọrịa ka zi nkụ ugbu a, na ọ bụ site na mgbatị ahụ a ka oji achụ ọrịa ndị a ọsọ." afirika-45319236,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319236,Kedụ ebe a nọ mee ntuliaka ọchịchị ime obodo nke Imo steeti?,Na ụbọchị Satọde gọọmentị Imo steeti mere ntuliaka iji nweta ndi ga-abụ ndị isioche n'ọchịchị ime obodo nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka steeti Bekee kpọrọ 'Imo state Independent Electoral Commision (ISIEC)' haziri.,"Ihe mere na ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti Ụnyaahu bụ ụka, ngalaba ntuliaka ahụ mekwara kpọ ndị meriri, nke pati na-achị steet ahụ bụ APC nwetera mmeri n' ọchịchị ime obodo 27 dị na steeti ahụ. Mana BBC Igbo gara nyocha ntuliaka ahụ okpuru ọchịchị ime obodo Okigwe were choputa na ọtụtụ ndị mmadụ adịghị njikede maka ntuliaka ahụ. Ọzọkwa, umunwaanyị na ndị ọzọ na-azụ ahịa pụtara ịtụ mgbere he. Ndị n'ime ha BBC Igbo gbara ajụju ọnụ jụru ihe ojiri bụrụ na ọ bụ ugbua ka a na-eme ntuliaka a. Ka ndi ọzọ kwukwara na uche ha adịghị n'ihe na-eme. Onye ntaakụkọ BBC hụkwara na akwụkwọ ntuliaka adịghị na ọdọ ntuliaka niile ọ gara n'Okigwe. Cheta na ọtụtụ ndi pati ọzọ n'Imo ekweghị iso mee ntuliaka a. Lee ihe anyị hụrụ n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46738350,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46738350,Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri - Di na nwunye kpuru isi,Ọtụtụ ndị nwere ọrụsị na Naịjirịa nọ n'okporo ụzọ dị icheiche na-arịọ arịrịọ.,"Mana di na nwunye a bụ Okwudili na Loveth Egbo ekweghị ka ọrụsị ha kwụsị ha ibi ndụ ha etu o kwesiri. Agbanyeghi na ha abuọ kpuru isi, ha kwekọrịtara lụọ onwe ha ma biri n'ụdọ ma mụtakwa ụmụaka. Ha nwekwara ọrụaka ha na-arụ nke ha ji enyere ndụ aka karịa ịga nọrọ n'ụzọ na-arịọ arịrịọ. Na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere, di na nwunye a kọwara etu ha siri kpaba nkata a ghọrọ ngịga. Kirie ya n'uju:" 44104379,https://www.bbc.com/igbo/44104379,Uche Ogbuagu: Okwu m emeela ka ndị enyi gbaara m ọsọ,Na mkparịtaụka BBC na onye ọkpaọchị ama ama bụ Uche Ogbuagu o kwuru na ọrụ ya emela ka ụfọdụ ndị enyi ya gbahapụ ya.,"O kwukwara ihe o jiri gbaa arụkwaghị na gọọmenti Imo Steeti mgbe ọ rụrụ ọrụ ebe ahụ. Ọ gbara ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'anwụ. N'aka ọzọ, BBC gbara mbọ ịnụ olu ndị ọrụ nọ na gọọmentị Imo Steeti nke taa. Anyi nwetere Mazi Sam Ọnwuemeodo bụ onye natakọkụ mgbasa ozi Rochas Okorocha, Gọvanọ Imo Steeti. Mazị Ọnwuemeodo sịrị na ya achọghị ikwu ihe ọbụla gbara Uche Ogbuagu. Pia akara a ka ị nụ ihe Onwuemeodo sara Uche Ogbuagu. Sam Onwuemeodo na Ihe ọsara Uche Ogbuagu Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53880815,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53880815,Ipob n'Emene: Ana m agara onwe m ụka mgbe a gbara m egbe- Nwoke a kụrụ ịga n'Ụlọgwụ 'Orthopaedic Enugwu',Otu nwoke nọ n'ụlọ ọgwụ Orthopedic Enugwu aha ya bụ Abraham Ani etiela mkpu sị ndị uwe ojii wepụ ya ịga ha kedoro ya n'ụkwụ n'ihi na ya abụghị onye IPOB.,"'Ana m aga ụka oge ndị agha ji egbe gbajie m ụkwa n'Emene' Abraham gwara BBC na nsogbu ya malitere ụbọchị ụka 23 August oge ndị IPOB na ndị uwe ojii nwere nsogbu. Abraham Ani sị na ndị uweojii kedoro ya n'akwa dị n'ụlọgwụ Orthopaedic dị n'Enugwu n'ihi na ha na-ebo ya na ọ bụ onye Ipob. ""Onye ọrụ nchekwa gbara m egbe n'ụkwụ n'ụbọchị 23 Ọgọst ndị IPOB na ndị uweojii nwere nsogbu n'Emene."" Okwuru na ya na-aga ụka oge ya zutere ndị na-eme ọgba aghara n'ihu St Josephs catjolic Churcj Emene, ngwa ngwa ya mere ka ya gbapụ ọsọ zoo, otu onye army agbajie ya ụkwụ. Abraham nọzị ugbua n'ịga ndị uwe ojii tụrụ ya wee na-akwa arịrị na ya na anyụzị nsị na mamịrị na bed n'ihi ịga atụrụ ya n'akwa ụlọ ọgwụ. Ụkwụ Abraham ka e doro n'akwa Ka ọ dị taa, Abraham kwuru na ya enweghịzị ego, were anya mmiri kwo na gọmenti kwesịrị inyeghachi ya ụkwụ ka ọ dị n'mbụ n'ihi na aka ya dị ọcha. Mgbe BBC Igbo kpokuru ndị uweojii ka ha tinye ọnụ n'okwu a, ha asị na ọ nọ n'ụzọ njem, na ọ ga-asa anyị n'oge adịghị anya. Akatọrọ m ogbugbu ndị ntorobia Emene mana anaghị m akwado otu IPOB - Annkio Briggs Otu nwaanyị a ma ama maka ịgba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Annkio Briggs agọọla si na o nweghị mgbe ya kwuru na ya na-akwado otu Ipob. Briggs pụtara n'akara Facebook ya kwuo na o nweghi mgbe okwu o kwuru iji katọọ ogbugbu mmadụ n'Emene ji ghọrọ na ọ na-akwado otu Ipob. O kwuru na ọ bụ ikike ruru ya ịkwụnyere otu ọbụla masịrị ya mana o nweghi mgbe o ji sonye otu Ipob. Cheta na o kwuburu na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ. Aloy Ejimako: 'Akwụkwọ gosiri ndị Ipob e gburu n'Emene bụ eziokwu' Ipob Emene: 'Akwụkwọ 'Intersociety' wepụtara maka ndị Ipob e gburu bụ eziokwu' N'aka ọzọ ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimako sị na o kwenyere n'akwụkwọ otu a kpọrọ 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' wepụtara maka ndị Ipob nwụrụ n'Emene. Ndị 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' depụtara aha ndị ha sị bụ ndị Ipob nwụrụ n'Emene n'ụbọchị ha na ndị DSS na ndị uweojii nwere Ọ sị na otu a bụ otu a ma ama dịka ndị na-eme nyocha nke ọma tupu ha a pụta kwuo maọbụ dee ihe ọbụla. Ejimako sị na ọ na-atara ozi ahụ n'akara e-mail ma leba ya anya, na ihe niile ha dere bụ eziokwu kama na o zuchabeghi ezu. Ọ sị na o kwenyere na ya ma kpọọ oku ka ndị Igbo na Naịjirịa niile kwenyere n'akwụkwọ a. Ọ gara n'ihu katọọ ogbugbu ụmụafọ Igbo n'Emene ma kwuo na ndị aka ha dị na ya ga-ata ahụhụ mgbe oge ruru. Otu a kpọrọ 'Intersociety' na-ahụ maka ikike dịrị onye wepụtara akwụkwọ ozi bu aha gụnyere aha ndị ha sị na e gburu, a nwuchiri nakwa a na-achọ achọ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na ndị Ipob n'Emene, Enugwu Steetị. Akwụkwọ ha a gosiri aha mmadụ isii e gburu egbu nakwa ndị ọzọ ha sịrị na a nwuchiri na ndị na-efu efu. BBC Igbo ka na-agba mbọ ị chọpụta ihe ndị uweojii nwere ikwu maka aha ndị a. O nweghị onye Emene so na ndị e gburu n'Emene - Igwe Emene Igwe Felix Ugwu, bụ eze ọdịnala nke obodo Emene dị n'Enugwu steetị gwara BBC ihe ọ ma maka ọgbaghara dara n'etiti ndị DSS na ndị Ipob nke butere ogbugbu mmadụ. Igwe Ugwu kwuru na ọ nweghị onye Emene so na ndị e gburu na nsogbu ahụ. Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ eso ihe nwere onwe maka ọ bụ ihe ejibu kwafuo ọtụtụ ọbala na gboo. Ọ sị: ""Ya bụrụ na ọ bụ uche Chukwu, anyị ga enweta nkewa Naịjirịa. Ya bụrụ na Chuwku ekweghị, anyị ka ga-anọkwa ebe anyi nọ. Anyị agaghị agbaghara ụdịrị ihe emere anyị n'Emene ọzọ - Nnamdi Kanu Cheta na onyeisi otu na-achọ Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu kwuru na ndị otu ya agaghị ekwezi ka ụdịrị ihe mere na Emene mee ọzọ, ọkachasi ebe o metụtara ogbugbu mmadụ. N'okwu okwuru na mgbasaozi o mere n'akara Facebok ya n'Abalị ụbọchị Wenesde, Kanu sị na ya agwala ndị otu ya ka ha dịrị njikere maka mwakpo ndị nchekwa obodo. Nke a na-abịa dịka aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi si ka ndị nara ndị uweojii ngwa agha ha weghachite ha. Ugwuanyi kwuru okwu a oge ọ na-ekwupụte ebumnuche a banyere ọbala a kwapuru n'Emene. Ihe Peter Obi kwuru maka ogbugbu ndị mmadụ n'Emene Onye bụbu gọvanọ Anambra Steetị bụ Peter Obi sokwa na ndị katọrọ ogbugbu mmadụ a mere n'Emene. Obi depụtara nke a n'akara twitter ya ma kpọọ oku sị ka e mee nyocha iji chọpụta ihe kpatara ya ma gbochie ya n'ọdịnihu. Onye na-agara onwe ya bụ onye e gburu, gbaa ọkụ n'Emene - Anya hụrụ ihe mere Ndị hụrụ ihe mere n'ụbọchị mkpamkpa kpara n'Emene sị na onye ahụ bụ onye na-agara nke ya ka e gburu maka na o ji ekwenti ya ese ka ihe na-eme. Mana amaghị ndị mmadụ gburu ya ma ree onye ahụ ọkụ. 'Igbo niile kwesiri ịpụta katọ ihe e mere ndị Ipob n'Emene'- Ọkaiwu Ipob Ma ndị Ipob, ndị uweojii na ndị DSS ekwebeghị kwuo mmadụ ole n'ime ha nwụrụ kpọmkwem kemgbe ya bụ ihe mere n'ụbọchị Sọnde 23 Ọgọst, 2020. Otu foto ndị mmadụ na-eke esighi Emene Otu foto ndị mmadụ na-eke banyere mkpa mkpa kpara n'Emene abughị ebe ahụ ka o si. [Gbado anya maka foto ndị n'akara e tinyere ebe a na-egosi ozu na ọbara mmadụ] Foto a bụ nke otu onye Ipob tinyere na Twitter ha. Mana, ya bụ foto si Mba Cameroon, ebe ndi oji egbe na gọọmentị enye nsogbu maka nwere onwe ndị a na-akpọ Ambazonia. Lee ebe o bu ụzọ sepute isi na Twitter n'ebe a. Foto ọzọ si Nairaland ebe nke nwaanyị ji ọkọrọtọ Biafra si ebe a, n'oge ndị Ipob na ndị agha Naijirịa zutere n'afọ 2018. Lee mpaghara Enugwu mkpamkpa kpara ụbọchị ụka Ọ bụ n'ụlọakwụkwọ Community High School ka ndi Ipob nọ tupu ndị DSS ezute ha Aga-eme nchọpụta n'ihe mere n'Emene - Ohanaeze Ndigbo Ohanaeze Ndigbo agbarụọla ihu n'ogbugbu ndị mmadụ mere n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka mgbe Ipob na ndị nchekwa kwasutara onwe ha. Nke a dị n'akwụkwọ ozi onyeisi otu a bụ Nnia Nwodo wepụtara nke Emeka Attamah bụ ndụmọdụ ya tinyere aka na ya. Ohanaeze sị na ihe mere ha ji gba nkịtị kamgbe ihe a mere bụ maka ha chọrọ ịmatacha etu ihe a si malite. Ha sị na ozi ahụ na-efegharị bụ nke a sị na Nnia Nwodo dere bụ okpotokpo asị na Nwodo ekwubeghi okwu ruo ugbua. Ipob na Ohanaeze Ndigbo Mana ha kpebiri iwepụta ozi a site na mkparịtaụka ha na gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu Steeti nwere n'ụbọchị Wenesde. Ohanaeze sị na gọọment Enugwu ekwela nkwa ime ka ha mata ihe niile ha chọpụtara banyere mmadụ niile nwụrụ n'ọgbaghara a. Ha gara n'ihu kwa arịrị maka ọnwụ ụmụafọ nakwa ndị ọzọ nke a metụtara ma ṅụọ iyi isi imi n'ala chọpụta ihe mere. Ohanaeze nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla dere juu ruo mgbe kọmitii gọọmentị Enugwu hiwere ga-emecha nyocha ha. Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akpọọla oku nzukọ kwam kwam nke ndị niile aka ha dị na nchekwa na steeti ahụ. Oku Ugwuanyi bịara abalị atọ ndị ọrụ ncheka na ndị otu Ipob kwakọrọ isi na steeti ahụ, nke butere ogbugbu ihe ruru mmadụ anọ. Ndị Ipob na-ekwu na ọ bụ mmadụ 21 ndị otu ha nwụrụ na ọgbaghara ahụ ebe ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) sị na mmadu abuọ ndi ọrụ ha nwụrụ. Briggs na Ezekwesili akatọọla ogbugbu ndị Ipob n'Emene Ipob Emene: Ifeanyi Ugwuanyi akpọọla nzụkọ nchekwa kwam kwam n'Enugwu Otu nwaanyị ọnụ na-eru n'okwu bụ Annkio Briggs akatọọla ogbugbu e gburu ndị otu Ipob n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka gara aga. Ọ sị na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ. Ọ sị na ndị otu a nwere ikike igbere chi ọbụla dị ha mma, ma ọ bụ ụka ndị Jew maọbụ nke Kraịst. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ hapụ ị na-agba nkịtị mgbe ọbụla e gburu ndị mmadụ n'ala Igbo maọbụ na Kaduna nakwa Naịjirịa gbagburu. Ihe Oby Ezekwesili kwuru N'otu aka ahụ onye bụbu mịnịsta agụmaakwụkwọ bụ Oby Ekwesili katọkwara otu ihe a mere n'Emene. O depụtara nke a n'akara twitter ya ma sị ka e mee nyocha banyere ihe kpatara ogbugbu ndị a. Hiwe 'panel' ga-enyocha ihe mere n'Emene - Ipob Ọtu na-achọ mwereonwe site na Naịjirịa bụ Ipob akpọọla oku ka e hiwe otu ga-enyocha ma chọpụta kpọmkwem ihe mere n'Eneme n'ụbọchị ụka. Otu onye so n'ọnụ na-ekwuru Ipob kpọrọ oku a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere banyere ọgbaghara dapụtara n'etiti Ipob na ndị ọrụ nchekwa. Ọ gara n'ihu sị na onweghi mgbe ndị Ipob mere ọgbakọ ji megide ndị ọrụ nchekwa gara kwasuo ha n'Emene dịka ime ọgbakọ bụ ikike dịrị onye n'iwu na Naịjirịa. O kwukwara na ndị uweojii ekwesighi igbu ndị Ipob, na ihe ha gaara eme bụ inwuchi ma kpọpụ ha n'ụlọikpe karịa ịgbagbusi ha. Onye ọzọ so na mkparịtaụka a bụ Chukwuka Ofoegbu (Ijele) sị na ndị Ipob kwesịrị ịma na iwu na Naịjirịa kpọrọ ndị na-eyi ndụ egwu nke bụ na ọgbakọ ha megidere iwu. Ofoegbu sị na ""ndị Ipob kwesịrị ịkwanyere onwe ha ugwu, na ọ dị njọ onye a na-azọ ndụ iji aka ya dabanye n'ọnụ agụ"". Ọ gara n'ihu sị na o wutere ya etu ndị mmadụ si nwụọ n'ụzọ na-ezighi ezi site n'ọgbaghara ahụ mere n'Enugwu. Kirie ihe ha kwuru n'uju ebe a: Anya a na-ele ndị Igbo adịghị mma - Guy Ikokwu Guy Ikokwu bụ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'oge agba nke abụọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria (Second Republic) Ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu esorola katọọ ogbugbu e gburu ndị ntọrọbịa Igbo n' ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na Ipob n'ụbọchị Ụka. Guy Ikokwu, otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ma bụrụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị welitere isi n'oge ọchịchị Shehu Shagarị gbarụrụ ihu maka ya. O kwuru na ndị na-achị anụ na-eji egbe na-emebi ihe mana o nweghị onye ọbụla n'ime ha ejiderela, kama na-egbusi ndị ntorobịa Igbo ejighị egbe ọbụla. Ikokwu sị na ""O nweghị obodo ụdị ihe ga-eme, ndị mere ya ala na nkịtị."" ""Ihe ha mere ụmụ anyị Osebuluwa ga-akwụ ha ụgwọ."" N'otu aka ahụ, onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Billie Human Right initiative' bụ Innocent Amadi. N'okwu ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị, Amadi sị na ihe nke a gwụrụ ike n'ihi na ndị a na-agbu bụ ndị na-ejighi egbe maọbụ mma. Ọ sị na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ nke ndị a na-emegbu emegbu mana o nweghi onye na-ekwu okwu banyere ya. Amadi gara n'ihu dụọ ndị Igbo ọdụ sị ka ha kwanyere onwe ha ugwu n'ihi na anya a na-ele ndị Igbo adịghị mma. Abaribe o kwuru gịnị maka mkpamkpa kpara n'Emene? Sinetọ Enyinnaya Abaribe akatọọla ogbugbu e gburu ndị mmadụ n'Emene. Ọ na-asị ka ndị gọmenti hibe otu nnyocha ga-eleba anya n'etu ihe jiri mee n'Ọgọst 23, 2020 n'Emene dị n'Enugu. Abaribe kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Awom. O kwukwara na etu oke ogbugbu si eme mgbe ọbụla gosiri na o nwere ihe ọzọ so ya n'azụ. Ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ na-akwado ime ọgbakọ maka Emene N'otu aka ahụ, onye nchịkọta otu gọvanọ ọwụwaanyanwu bụ ọkamụta Uchenna Ortuanya ekwuola na otu ahụ na-akwado ime ọgbakọ nlebanya gbasara mkpa mkpa mkpa kpara n'Emene. Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Ortụanya gwara BBC na ha na-eche ka oge ha ji eme ọgbakọ ruo ma na-ekwukwa na ha ga-eji aka ha kwupute ihe ha metere n'ọgbakọ ahụ. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mmadụ nọ na soshal midia akatọ nkịtị otu a gbara kamgbe ihe a mere. 'Kpọpụta aha ndị otu Ipob na DSS a sị nwụrụ n'ọgbaghara a' Nke ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ na ha chọrọ ka ewepụta aha ndị Indigenous People of Biafra(Ipob), DSS nakwa uweojii nọ n'Enugu kwuru nwụrụ n'ọgbaghara ahụ. BBC Igbo kpọrọ ndị isi Ipob nakwa ndị DSS ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na anọ ka wepụta ya bụ aha mana Ipob jụrụ ajụ ebe DSS kwuru na ha aghahị ewepụta aha ọbụla ugbua. Ohaneze ndị Igbo na-eme nnyocha Otu Ohaneze Ndịgbo nke Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị otu 'Indigenous People of Biafra' na ndị uweojii na steeti ahụ n'ụbọchị ụka. Onyeisi ha bụ Alex Ogbonna kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na mgbede Mọnde. Ogbonna kwuru na ya bụ ọgbaaghara nke butere ọnwụ ụfọdụ mmadụ, wutere ha nke ukwu. O kwuru sị: ""Anyị na-eleba okwu a anya iji matachaa etu ihe niile si mee."" ""Anyị na-akpọkwa oku ka gọọmentị leba anya n'okwu ma gbaa ya n'anwu."" ""Nkwa anyị na-ekwu bụ na ndị niile aka ha dị na ọgbaaghara ahụ agaghị ala na nkịtị. Oge BBC Igbo kpọkwara onyeisi Ohaneze Ndigbo na Naịjirịa bụ Nnia Nwodo, o kwuru na onweghi ihe ọbụla ya ga-ekwu n'ihi na ọ maghị ihe niile gbasara ya bụ okwu. 'Igbo niile kwesiri ịpụta katọ ihe e mere ndị Ipob n'Emene'- Ọkaiwu Ipob N'otu aka ahụ, ọkaiwu ndị IPOB bụ Alloy Ejimako akatọọla mkpa mkpa kpara n'Emene. O kwuru na o jọgburu onwe ya na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa ga-ahapụ ndị niile na-enye ala ahụ nsogbu ma chụwa ụmụ ntorọbịa na agbọghọbịa ala igbo na-ejighị ngwa ọbụla achọ okwu. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. Ihe nkiri gosiri etu dị mmadụ si gba ọsọ maka mkpamkpa a Ihe mere n'etiti ndí uweojii na ndí Ipob n'Emene, Enugu state 'Kwụsị ọgbakọ ndị otu Ipob niile n'Enugwu' - Nnamdi Kanu Okwu Ejimako na-abịa dịka onyendu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwara ndị otu ya nọ n'Enugwu steeti ka ha kwusịtugodu ọgbakọ ọbụla ka elu na ala jụlatatụ oyi. Kanu kwuru nke a n'okwu ya ụnyaahụ na Radio Biafra mgbe ọ na-ekwu maka mkpamkpa kpara n'Emene Enugwu n'etiti ndị uweojii na Ipob. Olu ndị uweojii gbasara ọgbaghara ndị Ipob na ndị uweojii N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe, ha na-akọwa na ihe ruru ndị otu Ipob mmadụ narị ise kwuchiri ụzọ na-agba taya ọkụ n'ụzọ niile, wee nwuchie ndị uweojii nzuzo bụ DSS. Akwụkwọ ahụ kwukwara na Kọmishọna ndị uweojii bụ Ahmad AbdulRahman zipuru ndịọrụ ya ka ha ga bịanyụọ ọgbaghara ebe ahụ. Ndịọrụ nchekwa ahụ gụnyere ndị DSS, ndị uweojii na ndị agha Naịjria gara ebe ahụ mgbe ndị otu Ipob malitere ịkwa ha mgbọ. Mgbe ha saghachịrị ha site n'ịkwa mgbọ, mmadụ abụọ ndị otu Ipob nwụrụ ebe mgbọ merụrụ ọtụtụ n'ime ha gbapụrụ ọsọ ahụ. Ọ sị na ha zọpụtara otu n'ime ndị DSS ahụ ndị Ipob jidere, were hụ mmadụ abụọ ndị otu ha ndị ọzọ n'ozu ka ha tọgbọrọ. Ndukwe kwukwara na e jidere mmadụ ise ndị otu Ipob bụ ndị kwetere na ha so na ya bụ otu a machiri amachị. Ọ sị na ndị ahụ sị na ha nọ ebe a na-enye ha ọzụzụ mgbasị ahụike. Ha sị na ha hụrụ mma, okpiri akụnyere ntu na ekwentị dị icheiche ebe ahụ. 'Ndị uweojii gburu ndị Ipob 21, nwụchie mmadụ 47 n'ọgbaaghara mere n'Emene'- Emma Powerful IPOB bidọ nghaghari iwe ya n'afọ 2012 N'aka nke ọzọ, Emma Powerful, bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Ipob, katọrọ mwakpo ahụ nke ndị uweojii wakporo ha n'Emene dị n'Enugu. Powerful kwuru na ndị otu ha nwụrụ mgbe a na-akwa mgbọ egbe ruru iri abụọ na otu ebe, ndị uweojii nwụchịrị mmadụ iri anọ na asaa. Gọvanọ Enugu emeela njem itiaka n'obi n'Emene, Enugu Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị agaala ebe ndị uweojii na Ipob nwere ọgbaghara . Ndị ọrụ nchekwa na ndị bi n'ogbe ahụ mere ka ọ ghọta na ihe adajụọla kamgbe ọgbaghara ahụ dapụtachara ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ. Ugwuanyị na ndị ọrụ nchekwa gara ebe ahụ na mgbede ụnyahụ. Mba Nnamdi Kanu bara maka Emene Kanu na uwe ndị Idoma Na mbụ, onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu tinyere ọnụ n'ihe mere n'Emene. N'ozi o depụtara n'akara Facebook ya, o kwuru na oge eruola mgbe ndị uweojii ga-aghọta na ogbugbu ndị ejighi egbe ga-akwụsị ""n'ala Biafra"". O kwuru na ihe mere n'Emene ka bụ mbido ihe ga-abịa ma kwuo na ọ bụrụ na agaghị ekwe ha (ndị Ipob) mee ngagharịiwe n'udo, ha ga-eme ya n'esemokwu. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a Lee ụlọọrụ ndị uweojii a wakporo mgbe ọgbaghara dapụtachara n'ebe ahụ Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị otu Ipob na ndị uweojii metụtara ụlọọrụ ndị uweojii nta dị n'Emene n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2020. A hụrụ ọkọlọtọ dị n'ihu ụlọ uweojii ahụ n'ala nke gosiri na awakporo ebe ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara. Mana ndị mmadụ laghachiwe n'ụlọ ha maọbụ ihe ha hapụrụ wee gbawa ọsọ ndụ. Ọgbaghara ahụ gafere ebe a Mgbe ihe a mechara, ndị uweojii ka anọchichara ụzọ n'ebe dịka Eke Obinagu akụkụ ebe esi abata Emene ma gbochie ndị si Orie Emene apụta ịgafe ezi ahụ. Úlọakị̀ụkwọ ebe ndị Ipob na-anọ eme nzukọ ha Nchọpụta anyị gosiri na ọgbaghara ahụ malitere n'ụlọakwụkwọ Community High school Emene si ya fere St patricks college fee Ukwu Mango gaa Orie Emene. ""A hụrụ m ka agbagburu mmadụ abụọ n'Emene"" -Anya hụrụ ihe merenu Maazi Henry nọ mgbe ihe a mere kọwara etu o si hụ ka e gburu mmadụ abụọ n'ihu ya mgbe ọgbaghara a dapụtara. Ọ kọwara na ihe a bidoro n'ụtụtụ ebe elekere asatọ mgbe ndị Ipob na-eme nzụkọ, na-ekpe ekpere, na-abụ abụ. ""Ndị DSS na SARS nakwa ndị uweojii batara n'ebe ahụ malite iti otu nwoke ihe, kụọ ya egbe ma merụọ ya ahụ. Nke a mere ka ndị ọzọ nọ n'ime ụlọ ahụ gbapụta bịa ịmata ihe na-eme."" O kwuru na ndị uweojii malitere ịgbasasi egbe ebe ahụ agbanyeghị na ndị mmadụ aka ha adịghị n'ihe merenụ na-eme ngafe ebe ahụ. ""Mgbọ tụtara mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ahụ ebe ihe ruru mmadụ iri isii merụrụ ahụ eburu ha gawa ụlọọgwụ"" Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ozu otu onye na-agba ọkụ ebe ahụ Mgbe ọgbaghara a dapụtachara n'etiti Ipob na ndị uweojii n'Emene dị n'Enugu, onye ntakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ozu otu onye ebe ọ na-agba ọkụ n'Orie Emene. Ndị bi n'akụkụ ebe ahụ gwara anyị na ọ bụ mgbe ndị otu Ipob maọbụ Massob na-enwe nzụkọ n'ukwu Mango dị ebe a hụ ka ndị uweojii wakporo ha. Gere ya n'uju ebe a: Emene:Etu ọgbaghara si dapụta n'etiti Ipob na ndị uweojii n'ebe ahụ Lee foto gosiri etu ọgbaghara ahụ si mee Ndị agha na ndị uweojii juputere ebe ahụ ugbua. Etu Emene dị mgbe mkpamkpa a kpachara" afirika-57108782,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57108782,Peruzzi: Ihe jikọrọ mụ na Chioma na ihe masịrị m maka ndị Igbo,Tobechukwu Okoh Victor bụ otiegwu a ma dịka Peruzzi ekwuola etu o si bụrụ onye a ma ama n'iti egwu ugbua.,"Peruzzi gwara BBC Igbo ihe o che maka 'esemokwu' dị n'etiti ndị otiegwu David Adeleke (Davido) na Ayo Balogun (Wizkid). Ọ kọwakwara ihe jikọrọ ya na Chioma bụbu enyi nwaanyị Davido, bụ onye akụkọ fesara na ha abụọ yịrị tupu o zute Davido. Peruzzi kwukwara ihe o che maka ịbụ onye Igbo nakwa ihe ndị ọzọ. Gere ya n'uju ebe a Ndị mere akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Vining Ogu Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46176670,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46176670,Minimum Wage: Buhari mee ọsịsọ ka ndị omeiwu tinye ọnụ - NLC,Akụkọ dị mkpa taa. NLC,"Ndị otu ""Nigerian Labour Congress (NLC)"" arịọla onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ gbaa mbọ hụ na o nyere ndị ụlọomeiwu akwụkwọ mbụli ego opekatampe o kwere na nkwa, ka ha nwee ike mezuo ya ọsịsọ. Peter Eson-Ozo bụ odeakwụkwọ NLC kwuru na ha na-ekwe ndịọrụ Naịjirịa nkwa na mgbe akwụkwọ ahụ ruru ụlọomeiwu, na ha ga-ahụ isi ya. Ndị NYSC Enugwu Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi, ekwela nkwa na ndị na-efe ala nna ha niile ga-esonye n'usoro ntuliaka 2019 na steeti ya, ga-anata nchekwa pụrụiche. O si n'ọnụ Josef Udedi bụ kọmishọna na-ahụ maka egwuregwu na steeti ahụ kwuputa nkea ka ndị na-efe ala nna ha n'Awgụ si n'ogige ha na-apụta. Na mba ofesi, Mmadụ anọ fọrọ n'ime iri asatọ na otu ndị ntọ tọrọla n'obodo Bamenda dị na Kamerun, apụtala. Ruo ugbua, amabeghị ndị tọrọla ha, makana gọọmentị na-ekwu na ọ bụ ndị isi ekwe ọnwụ si na mpaghara Kamerun na-asụ Bekee, mana ha agọrọla aka ha sị na ha amaghị maka ya. N'egwuregwu, Otu West Ham na-akwado ilele ahụike Samir Nasir gbabuuru Arsenal na Manchester City bọọlụ. Cheta na a machiri Nasir ịgba bọọlụ ọnwa iri na asatọ, ka a chọtara ọgwụike n'ahụ ya. Nyocha Diezani Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC ekwuola na ha ebidola atụmatụ ga-eme ka onye bụbu minista mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison Madueke laghachite Naịjirịa. EFCC na-achọ ka ọ lata bịa zara ọnụ ya maka ebubo na o zuru ego dị dọla ijeri iri itoolu mgbe ọ nọ n'ọkwa dịka minista. Ọzọ Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị uweojii anwụchiela Hope Uzodinma n'ọdọ ugboelu nke Abuja n'abali ụbọchị ụka maka n'ụlọọrụ ya arụghị ọrụngo nke ngalaba NPA nyere ha.. Mana onyeisioche APC n'Imo steeti bụ Dan Nwafor kwuru na ha anụbeghi ya bụ akụkọ. Na mba ofesi Ọkụ na-agba n'ọfịa obodo Kalifonia egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ n'otu. Ọkụ ahụ nke bidoro kemgbe ụbọchị tụsde achụpụla ihe ruru mmadụ puku narị abụọ na be ha ebe ndịọrụ gbatagbata ka na-achọ mmadụ narị abụọ. N'egwuregwu, Otu super eagles nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-ebido nkwado maka ịtozu asọmpị AFCON n'Asaba n'ụbọchị taa bụ Monde., Ha na-akwado ịzute Bafana Bafana nke Saụt Afrịka n'ụbọchị satọde n'abịa. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ihe Chioma Udeh nke Afriff gwara BBC Igbo Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51385106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51385106,"""Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m"" - Emeka Adindu",Onye nkuzi egwu Salsa bụ Emeka Adindu agwaala BBC Igbo etu egwu Salsa si zọ ndụ ya.,"O kwuru na ọ bụ mmetọ n'ụzọ mmekọ ahụ ọ gabigara mgbe ọ bụ nwata mere ka o malite ịche echiche ịgbu onwe ya ka o ji gbakwuru Salsa. ""A chọrọ m ịkọ akụkọ m ka ndị nne na nna anyị were mụta akọ n'ebe ụmụaka ha nọ"" ka o kwuru. Ugbua o kwuru na o ji akara aka a enyere ndị ọzọ obi ha na-ada mba aka. Akụkọ a si n'aka Jessica Nwankwo na Vining Ogu." afirika-47007575,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47007575,"Chief Justice of Nigeria: Buhari achụọla Okaikpe Onnoghen, nye Tanko Muhammad ọkwa",Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Onyeisiala Muhammadu Buhari chụpụrụ ọkaiwu ukwu Naịjirịa eboro ebubo na-okwughi ego dị n'ulọ akụ ya.,"Onye dere maka ihe a bụ onye enyemaka Onyeisiala Buhari na soshal midi bụ Bashir Ahmad. Akara Twitter onyeisiala mechara dee na Ọkaikpe Ibrahim Tanko Muhammad anụọla iyi ọrụ iji nọchite anya Onnoghen. End of Twitter post, 1 Ọkaikpe Tanko ga-anọdụ ruo mgbe onye ọzọ ga-apụta dịka Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa. Amụrụ Tanko Muhammad n'afọ 1953 n'obodo Doguwa ndị n'okpuru ọchịchị ime obodo Giade di na Bauchi Steeti. Ihe a Onyeisiala Buhari mere emela ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu okwu na social media. Ụfọdụ sị na ihe a Buhari mere abụghị ihe iwu Naịjirịa kwadoro. Ụfọdụ, dika aka na-achi Kaduna steeti bu Nasir El-Rufai, na-akwado ya. Ndi ọzọ na-ajụ ma Onyeisiala Naịjirịa onwere ikike ịchụ Ọkaikpe ukwu mba ahụ." afirika-47090997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47090997,PDP Ebonyi rally: Ndị Awụsa bi Ebonyi steeti soro pụta ịkwado Atiku na Obi,"Dịka Atiku Abubakar , onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP gara ọsọ achumta vootu n'Ebonyi steeti ụbọchị Fraide, ndị Awụsa nọ n'steeti ahụ pụtara n'ụzọ ụzọ ikwado ya.",Ndị Awụsa karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ gbakọrọ n'Unity Square Abakaliki were egwuregwu na ihe ngosi dị iche iche na-egosiputa nkwado ha n'ebe Atiku Abubakar na Peter Obi nke PDP nọ. Ha kọwara na ha na-ebi n'udo kemgbe ha bịara n'obodo ahụ.Onyeisi ndị 'Hausa Pilgrim Board Ebonyi state' bụ Alhaji Issa Yinusa kọwara na asụsụ igbo na Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga ha bi na steeti ahụ ndị Awụsa maọbụ Fulani enwebeghị nsogbu ọbụla. Yinusa kwere nkwa na ọ bụ Atiku na Peter Obi ka ha ga-atinyere akwụkwọ ntuliaka. Lee ihe ha gwara BBC Igbo n'ihe nkiri a: Akụkọ ga-amasị gị: afirika-56683062,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56683062,Bruno Iwuoha: Ihe ị kwesịrị ịma maka ya,"Dịka otu jikọrọ ndị ejije na Naịjiria bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) si kwuo n'ozi ha zipuru, Bruno Obinna Iwuoha bụ ome ejije a ma ama anwụọla ka ọ dị afọ 68, ọ rịara ọrịa tupu ọ nwụọ.","Iwuoha nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Satọde, 10 nke ọnwa Epreelụ 2021, ka ọ rịachara ọrịa shuga. Ndị otu ya gụnyere Emeka Rollas bụ onyeisi otu AGN, tiri ezinaụlọ ya aka n'obi, dịka o kpekwara ekpere ka chukwu nwee ike ịgba ha ume. Emeka Rollas gwara BBC Igbo na Iwuoha banyere 'coma' kemgbe izu atọ gara aga, tupu ọ nwụọ; ma kwukwaa na ọnwụ ya na-ewute ha nke ukwuu. O jikwa ohere a na-akpọku ndị otu ya na Nollywood ka ha gbaa mbọ hụ na ha sonyere n'atụmatụ AGN nwere iji kwado ahụike ndị mmadụ, nke ọ sị ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike na-achọpụta ọrịa na-arịa ha tupu ọ bụrụ nnukwu nsogbu. Rollas kwuru na enweghi mgbe ọbụla o ji ụgwọ ụtụ a na-akwụ dịka ndị otu AGN. O kwukwara na ọ bụ otu onye na-enyekarị ya bụ Rollas ndụmọdụ dịka onye nna, na-asị ya na ọ ma na ọrụ na-ejukarị ya aka, mana ọ ma na Chukwu ga-enye ya amara ịrụ ya bụ ọrụ. Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Bruno Iwuoha" afirika-53325945,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53325945,School closures: Coronavirus emeela m ihe ọkụ ji nti oke eme - Onye nkuzi ụlọakwụkwọ nọrọ onwe ya,Otu onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ bụ Amarachi Madumere akọwala etu mmechi ụlọakwụkwọ n'ihi coronavirus si metuta ya na ezinaụlọ ya.,Ọ sị na ọ dịzi ka onye na-enweghi ọrụ kamgbe e mechiri ụlọakwụkwụ n'ọnwa Maachị n'ihi coronavirus. Madumere sị na kemgbe Maachị ahụ na o ribeghi ụgwọọnwa ya. Kama nọ bụ obere azụmaahịa ka o ji na-enyere onwe ya na ezinaụlọ ya aka. Kirie ihe o kwuru n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44882531,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44882531,Ndị ọrụoyibo ga-amata ụkwọ opekatampe ọhụrụ n'Ọgọst - TUC,Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ oyibo na Naịjirịa akpọrọ Trade Union Congress (TUC) na-aha ịchafụ ekwuola na gọọmenti etiti ga-agwa ọha ihe pụtara n'ọgbakọ ha na ndị kọmiti ehibere maka ịlebe anya na ụkwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ oyibo kpatara ụnyahụ n'Abuja.,"Ndị ọrụ Enugwu na-egosipụta obi ụtọ ha Bobboi Kaigama gwara ndị nta akụkọ na ọbaghị uru itupe ya bụ azụ dị na ngwugwu ebe ọbụ na gọọmentị etiti ekwela nkwa ịgwa ọha ego ole a ga-etinyere ha n'ụgwọ onwa dịka ego opekatampe n'Ọgọst afọ a. Kaigama mere ka amata na ya bụ kọmiti nke gọọmenti etiti hibere ekpebiela ego ole a ga-etinyere ha dịka ego opekatampe nke ha kwetere na a ga-ebido kwuwa n'ọnwa September 2018. Oteela ndị ọrụ oyibo tụwara anya ka ebuliera ha ụgwọ ọnwa nke e kwetere na-oso n'ụkwọ ọnwa nke kacha nta n'ụwa gba gburugburu, ebe ndị omeiwu Naịjirịa kacha eri ụgwọọnwa n'ụwa nịịle, dịka akụkọ sị kwụọ. Kemgbe afọ gara aga ka ndị ọrụ oyibo mailitere iti mkpụ ụgwọọnwa opekatampe nke ha na-arịọ ka esi na N18,000 ebulie were ruo N66,500. Cheta na minista na ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuburu na ibuli ego opekatampe ndị ọrụ abụghị ihe na-eche gọọmenti ha ugbua. Akụkọ ga-amasi gị" afirika-46417552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46417552,Lee ka mmemme Ikeji Aro siri kpọtụọ,Ndị Arochukwu bụ ndị ji omenaala ha eme ọnụ.,"Na nsonso, ụmụ Arọ dị bi n'ụlọ na ndị bi n'ọhịa lọtara n'igwe n'ala Arochukwu maka emume iri ji ọhụrụ ha. BBC Igbo gara ebe ahụ ma na-ewetara gị ka o siri mee:" egwuregwu-44427598,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44427598,World Cup 2018: Super Eagles ga-agafe agba nke mbụ - Ndị Naịjirịa,BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị maara akụkọ egwuregwu nkeọma ajụjụ banyere ogogo ha chere ndị Super Eagles ga-eru n'asọmpị ahụ.,"Nwada Chisom Mbaọnụ onye ntaakụkọ egwuregwu kwuru na otu ha nọ n'ime ya siri ike mana ndị Super Eagles ga-agafe agba nke mbụ. Onye ọzọ bụ Faith Oluchi kọwara na asọmpi Iko Mba Ụwa abụghị nke ụmụaka, kama nke eji ama ndị bụ nwoke. Chidiebere Ezeani kwuru na NFF akwadola ndị Super Eagles Nkeọma maka asọmpi a, mana o kwenyeghi na ha tozuruoke ibu Iko a. Ebe nwada Elizabeth Obong-Daniels kwuru na ihe kachasị mkpa bụ ka Super Eagles gbaa bọọlụ mara mma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44917603,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44917603,Boko Haram wakporo anyị n'ezie - Ndị agha Naịjirịa,Ndị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Boko Haram awakpoola ọdọ ndị agha Naịjirịa nke agba '233 Battalion' n'okpuru ọchịchị Babbangida nke Yobe steeti ụnyaahụ.,"Ndịagha Naịjirịa ekwuputaghị mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a Nke a ga-eme ya nwakpo abụọ a ga-eme ndị agha Naịjirịa n'ime abali ole na ole gara aga. Ndị agha kwuru na ha gbara mbọ napụta ndị Boko Haram ahụ ike n'obodo ahụ ma chụpụkwa ha. E mefuru ndụ ụfọdụ ndị agha n'ọgụ a lụrụ mana ekwuputabeghi ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ na ya. Dịka ọ dị ugbua, ndị agha elu jisike enyocha mpaghara ahụ ịchọta ndị ka dị ndụ ma ndị oyiegwu na-ezo ezo. Ndị agha ahụ rịọrọ ndị mmadụ ha ekwela ka obi mapụ ha maọbụ tụọ egwu. Cheta na a nụrụ kepu kepu na ndị agha ruru mmadụ 28 nwụrụ n'izuụka gara aga ebe ndi Boko Haram wakporo ha ma gbaa ụfọdụ ụgbọ agha ọkụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45845321,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45845321,APC eboola Obasanjo ebubo maka Atiku,Otu ndọrọndọrọ ọchịọchị All Progressives Congress eboola onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ebubo na ọ na-emagbasị mbọ ike ịhụ na mba Amerika nabatara Atiku Abubakar bụ onye ji ọkọlọtọ otu PDP.,"Atiku Abubakar bụ osote onyeisiala Naịjirịa na-etiti afọ 1999 nakwa 2007 N'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchiri APC bụ Yekini Nabena zipuru ndị ntaakụkọ, o kwuru na Obasanjo chọrọ ka Amerika kabiri aha Atiku dịka onye ha dara iwu na agaghị enye ya akwụkwọ ikike ịbata n'ala Amerika. Nabena dere na Naịjirịa kwesiri icheta na oge Atiku bụ osote onyeisiala, Obasanjo boro Atiku ebubo mpu na aghụghọ. O kwukwara na Naịjirịa kwesiri ịcheta na ngalaba na-ahụ maka mpu, ohi na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crimes ka na-enyocha ebubo n'ishi Atiku maka ebubo ịnaka azụ ruru dọla puku nari ise. Akụkọ ga-amasị gị" 46441790,https://www.bbc.com/igbo/46441790,DSS anwụchiela Nwaanyị sị na ya bụ Aisha Buhari,"Ndị uweojii nzuzo nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ kwuru na nwaanyị a kpọrọ Amina Mohammed, maọbụ ""Justina Oluoha"", na ""Amina Villa"" dịka e jiri mara ya tụburu asị sị na ya bụ nwunye gọvanọ Kogi steeti were si ụzọ ahụ mịbata n'oche ọchichị Aso Rock n'Abuja.","Ndị uweojii nzuzo kwuru na Amina Mohammed jiri aghụghọ napụ otu onye ojiegoachụego $414,000 Nwaanyị ahụ gara n'ihu, ịkpọ ndị mmadụ oku ka ha bịa na nwunye onyeisiala na-akpọ ha. Mana n'ọgbakọ a kpọrọ ndị ntaakụkọ nwaanyị ahụ eboro ebubo gọọ sị na 'ọ bụ asị,"" Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nzuzo bụ Peter Afunanya,kwuru na nwaanyị ahụ kpara arụ ahụ n' ọnwa Novemba afọ 2017, oge nwunye onyisiala bụ Aisha Buhari gara njem. Amina Mohammed jiri aghụghọ napụ otu onye ojiegoachụego a kpọọ Alexander Chika Okafor ego karịrị puku nari paụd anọ(($414,000, £323,000)) maka ụlọ dị na Legos. Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Mr Afunanya kwuru na ""nyocha DSS mere gosiri na o nweghị ka aka nwunye onyeisiala siri dị na ya bụ nkata a kpara."" O kwuru na Mohammed kpanwuru ụdị ajọ agwa a n'ihi na anaghị etinye anya na mmiri enyocha ndị ọbịa dị oke mkpa dịka nwunye gọvana, ndị mịnịsta nakwa ndị welitere isi na ha bịa n'ụlọ onyeisiala. Onye ntaakụkó BBC bụ kwuru na ya bụ ihe bụ ọ gbara Igbo gharịị n'ihi na uweojii nzuzo nakwa ndị uweojii nkiti na-eche Aso Rock ka agụ na-eche nwa ya; Ndị na-arụ ebe ahụ nwechara akwụkwọ njirimara nke nwere akara aka ha n'ime ya(biometrics), ebe onye ọbụla batara na-edebanye aha n'akwụkwọ. Ụzọ atọ ị ga-esi amata onye ji aha ndị mmadụ atụrụ mmadụ ego Ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Patrick Agbambu, kọwara na ọ bụ agwa mmadụ ka e ji ama ma ọ bụ onye na-asị na ọ bụ onye ọ bụghị. Lee ihe atọ dị mkpa ọ rụtụrụ aka: 1. Ha anaghị enwe ndidi Ha chọrọ ihe ha chọrọ inweta n'aka gị n'ọkụ n'ọkụ n'ihi na ha achọghị ka i nwee ohere mee nchọpụta banyere ha. 2. Ha anaghị achọ ka gị na ha hụ ihu na ihu Gbaa mbọ mee ka gị na onye ahụ hụ ihu na ihu n'ihi na nke a bụ ihe ọ chọghị. 3. Ọ na-amasịkarị ha ịkpọ aha ndị nnukwu mmadụ Ọ bụrụ na onye gị na ya na-aka ụka na-etu ọnụ na ya nnukwu mmadụ nke a maọbụ nke ọzọ bụ enyi maọbụ nwanne, nyoo ya enyo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49679600,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49679600,Xenophobia Attacks: Ihe chere ndị si South Africa lọta,"Dịka ụmụafọ Naịjirịa gbara ọsọ ndụ site mba Saụt Afrịka lọta na-enwe aṅụrị maka nchekwa ndu ha, BBC Igbo gara n'ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed dị na Legọs ga leta ha.","Dịka ụmụafọ Naịjirịa gbara ọsọ ndụ site mba Saụt Afrịka lọta na-enwe aṅụrị maka nchekwa ndu ha, BBC Igbo gara n'ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed dị na Legọs ga leta ha. BBC Igbo zutere ụmụafọ atọ kwuru maka njem ha na olieanya ha ugbua ha lọtara. Francis Uwadiegwu, Christian Ejike na Nnamdi Basil sị na ndụ bụ isi mere ha Jiri kwakọọ, tichaa ụkwụ ha banye ụgbọelu na-alọta Naịjirịa. Gee ha ntị n'ihe nkiri a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44423393,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44423393,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Anthony Joshua eritela ntulugo ọhụrụ,Okwu APC na Okorocha ka na-aga...,"Ndị ndụ APC na-agwa Okorocha ya siri ụzọ ziri ezi kwuo uche ya Otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC adọọla aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha aka na ntị maka ịbo onyeisioche ha ebubo dị ịcheiche Cheta na Okorocha boro onyeisioche APC bụ John Odigie-Oyegun ebubo na o kwanyeghị iwu ụlọikpe nyere gbasara ntụliaka imeụlọ APC na steeti ya ugwu. Ọzọ Kemi Adeosun bụ onyeisi ngala na-ahụ maka ego na Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara akụnụba ọha esila n'ọnụ onyeisi ha bụ Alex Okoh kwuputa na gọọmentị na-akwado ịre ọtụtụ akụnụba Naịjirịa. Okoh kwuru na nke a bụ ịji leta ego a ga-eji mezuo bọjeti nke afọ a. Na mba ofesi, Ndị e chere na ha bụ ndị oyiegwu Al-shabbab egbuola onye agha mba Amerịka na ndịda mba Somalia taa. Ndịagha Amerịka ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe a wakpọrọ ha n'obodo Kismayo. N'egwuregwu, Nwa-afọ Naịjirịa ama ama n'egwuregwu ịpịa ọkpọ bụ Anthony Joshua eritela ntuliugo a kpọrọ 'Order of the British Empire'. Ntuliugo a bịara ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ezenwaanyị mba Britain ma cheta kwa n'oritela ntuliugo yiri nke a bụ MBE maka ike ọ kpara n'asọmpị Olympics n'afọ 2013. Gee akụkọ mere n'ime otu nkeji n'ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe ọzọ ị kwesiri ị ma: Kanayo O. Kanayo na-akwado ị zọ ọchịchị ọkwa ụlọomeiwu. Kanayo O. Kanayo: Ihe m jiri chọọ ịzọ ịga ụlọomeiwu" afirika-47684156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684156,Sexual Assault: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ gbara nwaanyị ọtọ,Ndị uweojii nwụchiri mmadụ atọ ahụ maka ha gbara nwaanyị ahụ ọtọ ma mebọọ ya n'ime ihe onyonyo na-efegharị.,"Akụko kwuru na nwaanyị ihe mere bụ Ogochukwu Okafor na Ifeanyi Azotani bụ enyi n'igwe soshal midia bụ Facebook. Ọ bụ Ifeanyi ratara nwaanyị ahụ na be ya tupu nwunye ya na enyi nwunye a gbaa ya ọtọ seta ya n'ihe onyonyo. Akụko kwukwara na ha gwara nwaanyị ahụ bụ Ogochukwa ya kwụọ puku naira iri isii maọbụ ha ekesaa ya bụ ihe onyonyo. Mgbe Ogochukwu jụrụ ịkwenye n'iji egwu anapụ mmadụ ihe bụ ihe ha chọrọ ịme ya, ha gara n'ihu kesaa ihe ha setere. Ndị uweojii ekwuola na ha ga-akpụpụ mmadụ atọ ahụ ụlọikpe maka ihe a ha mere." afirika-45526609,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45526609,'A chọtala nwa m nwaanyị e zuru kamgbe Mee' - Nne nwa,"Nne nwantakịrị nwaanyị bụ Blessing Adaobi, onye na-efu efu kamgbe ọnwa Mee afọ etiela mkpu ọṅụ dịka ndị uweojii chọtara nwa ya nwaanyị na ndụ.","Blessing bidoro ifu oge onye ọbịa agbataobi ha kpọrọ ya pụọ nke mere ahụghịzi ya rue ugbua. Mana nne ya bụ Kosarachukwu Onumaegbu gwara BBC Igbo na ndị uweojii jidere otu nwaanyị aka ya dị wee ree nwa ya ahụ bụ onye kọwara na ikpeazụ ya hụrụ Adaobi bụ n'isi mmiri Ọnịcha. O kwuru na ndị uweojii ahụ gara Ọnịcha mana ọ bụrụ na e rekwala Adaobi gaa Ebonyi steeti. Kosara kwuru na oge ndị uweojii ahụ ruru n'Ebonyi steeti, e kwuru na onye zụrụ Adaobi nwa ya anwụọla mana ndị agbataobi nọ na-eleta ya. O tipuru mkpu ọṅụ wee kọwara BBC Igbo na otu ihe nyere ya obi isi ike oge a niile bụ na ya nwere nchekwube na nwa ya ka dị ndụ. Kosara kwuru na nwa ya ga-alọta tupu ụbọchị ụka. BBC Igbo ga-ewetakwara gị akụkọ oge ọ lọtara." afirika-48765596,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48765596,Okoroji House Museum: Ihe ọkpụ fọrọ maka ịgba ohu n'ala Igbo,Ị ma na ndị Igbo gbara ohu tupu ndị ọcha abịa?,Lee ihe ndị fọrọ be otu nwoke a kpọrọ Okoroji n'Arọchukwu dị n'Abịa steeti. Ndị ụmụụmụ ya chekwara ụfọdụ ihe a iji chetara Igbo maka akụkọ ihe mere oge gboo. afirika-52533425,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52533425,Lockdown Ease: Etu ụfọdụ akụkụ mpaghara ọwụwa anyanwụ dị ka akwụsịtụrụ Lockdown,"Taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Mee 2020, ka Naịjirịa malitere ịlaghachị n'etu ndụ dịbu tupu e mee 'lockdown' n'ihi coronavirus.Mana ndị mmadụ egere gọọmentị ntị n'iwu niile gọọmentị kwuru bụ ihe a ga-eme iji gaa n'ihu n'udo?","Gọọmentị tinyere ụfọdụ iwu gụnyere : 1) onye ọbụla ga-ekpuriri mkpuchi imi ma ọ pụta n'ezi 2) Onye ọbụla nọsapụ anọsapụ bụ nke a kpọrọ ""social distancing"" na Bekee 3) Onye ọbụla gbaa mbọ na-akwọ aka ma a gụrụ gụrụ, wdgz.Mana ihe ndị a emere taa ka ndị mmadụ malitere ịpụta ezi? Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ihe ha hụrụ: @Coal_City kwuru na ahịa Ọgbete zụrụ n'Enugwu, mana e kweghị ka ndị eyighi mkpuchi imi bata n'ime ahịa. @AmbMcDons tinyere foto gosiri igwurube mmadụ n'ahịa Ọgbete, ebe ụfọdụ yi mkpuchi imi ebe ndị ọzọ eyighi. Ndị Abịa Facts Newspaper tinyere Ihe nkiri gosiri ka igwe mmadụ si nukọrọ na-agafa akwammiri Niger bụ oke dị n'etiti Anambara na Delta steeti. @tope_bisade tinyere ihe nkiri gosiri ka ndị mmadụ si nọrọjuo n'ime ụgbọala na Legọs, n'agbanyeghị na gọọmentị gwara ndị na-akwọ ụgbọala ebula ọtụtụ mmadụ n'otu oge. @tope_bisade gosikwara etu ndị mmadụ si ju ma ghara ịnọsapụ anọsapụ n'ụlọakụ, dịka ha na-azọ ụzọ ka ha nwee ike ịbanye n'ime ụlọakụ. @r3al__AJ kwuru na ebe a na-adọrọ ego juru eju ma na Legọs ma n'Abụja, ma kwuo na ọ dị ka ọ bụ ekpere ka ndị mmadụ ga-eji na-echekwa onwe ha. Etu ụfọdụ akụkụ mpaghara ọwụwa anyanwụ dị ka akwụsịtụrụ Lockdown N'Anamabara, ndị bịara Eke Awka ekpụghị ""Facemask"" Ndị mmadụ na-ekwo n'ahia akpọrọ Eke Awka. Ụgbọala juputere n'ahịa ahụ. Okporoụzọ secretariat dị n'Anambra ekwuochaghị ekwo etu o si ekwo na mbụ. Ahụghịkwa kpachị kpachị na-adị na ""Aroma junction"" taa bụ ụbọchị emepenatara obodo. Ụlọ ahịa emepewala ntakịrị ntakịrị n'Enugwu Dịka gọmentị Enugwu siri kwuputa, ọdụ ahịa Main Market Enugwu ejirila nwayọọ na-emepe tata bụ ụbọchị anọ nke Mee. Gọmenti nyere ndị ahịa ahụ iwu ka ha malite tata rebe ihe nrị na ọgwụ tata site n'elekere asatọ nke ụtụtụ kwụsi na elekere abụọ nke ehihe. BBC gagharịrị gburu gburu Enugwu, wee hụ na ụlọ ahịa ndị nọ na streeti ka gbachiri agbachi, mana ọtụtụ mmadụ apụtawala iro. Ahịa Kenyatta Enugwu gbachiri agbachi ebe ndị nri nọ n'ihu ya na-azụ ahịa. N'Anamabara, ndị bịara Eke Awka ekpụghị ""Facemask"" Ndị mmadụ na-ekwo n'ahia akpọrọ Eke Awka. Ụgbọala juputere n'ahịa ahụ. Okporoụzọ secretariat dị n'Anambra ekwuochaghị ekwo etu o si ekwo na mbụ. Ahụghịkwa kpachị kpachị na-adị na ""Aroma junction"" taa bụ ụbọchị emepenatara obodo. Na Legọs, Ndị ahịa Ladipo kwopụtara imata ebe ha ga-amalite wee zụwa ahịa ha. Anyị ga na-ewetere ụnụ ka steeti dị iche si emepenata ebe a ka e mechara Lockdown ruo izu ụka anọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51396055,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51396055,Imo State: 'Ọ bụ PDP ka ọ dịrị ịsa Mbaka okwu' - Onye mgbasaozi Ihedioha,Odeakwụkwọ mgbasaozi akachiburu Imo steeti bụ Chibuike Onyeukwu‎ sara Rev. Fr. Ejike Mbaka nke Adoration Ministry okwu ọ gwara Emeka Ihedioha.,"Ọ sị na ha 'agaghị asa Mbaka okwu ọbụla gbasara ihe ahụ o kwuru maka na ọ bụghị ha ka ọ diiri ịsa ya bụ okwu'. Ọ sị na ọ bụ pati ha bụ PDP ka ọ bịịrị ịsa ya bụ okwu. N'oziọma o ziri n'Adoration ministry n'izu a, Mbaka dọrọ Ihedioha aka na ntị ya kpachara anya maka ihe ọ na-ekwu gbasara ọchịchị ya ụlọikpe kachasị kpagburu. Mbaka sị na ọ bụrụ na Ihedioha akpachaghị anya, ọ gaa mkpọrọ maka okwu ya. Sineti ahọpụtala ndị ga-etinye anya n'akwụkwọ iwu Naịjiria Onyeisioche ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akpọpụtala aha mmadụ iri ise na isii (56) dịka Kọmitii ndị otu ya hibere ilebanye anya na maka ịhazigharị iwu Naịjria. Lawan kwuru nke a n'ọgbakọ ndị Sineti taa bụ Tọzde, ebe ọ nọ kwuo na esetechere mmadụ n'ọgbọnta vootu dị icheiche ime ka ndị ọbụla nwee ndị nnọchiteanya na ya bụ kọmitii. Ndị nwere agba na ya bụ kọmitii gụnyere: Osote onyeisoche Sinet bụ Ovie Omo-Agege (Onyeisioche kọmitii); Onyendu Sineti, Yahaya Abdullahi; Osote onyendu, Ajayi Boroffice; Onyeisi pati ndị ejighị ọchịchị, Enyinnaya Abaribe; Osote ọchọudo nke Sinet akpọro Deputy Whip, Aliyu Sani Abdullahi; Onye na-esote onyeisi ndị pati na-anoghị n'ọchịchị, Emmanuel Bwacha; Ọchọudo nke ndị pati na-anọghị n'ọchịchi bụ Minority Whip, Philip Aduda; na osote ya bụ Deputy Minority Whip, Sahabi Alhaji Ya'u. Ndị omeiwu ahọtara na mpaghara dị icheiche bụ:Theodore Orji, Abịa; Aishat Ahmed, Adamawa; Bassey Akpan, Akwa Ibom; Stella Oduah, Anambara; Haliru Jika Dauda, Bauchi; Biobarukuma Deji-Eremenyo, Bayelsa; Gabriel Suswam, Benue; Abubakar Kyari, Borno; Gershom Bassey, Krọs Riva; James Manager, Delta; Samuel Egwu, Ebonyi; Matthew Urhoghide, Edo; Opeyemi Bamidele, Ekiti; Ike Ekweremadu, Enugwu; na Mohammed Danjuma Goje, Gombe. Ndị ọzọ bụ: Rochas Okorocha, Imo; Sabo Mohammed, Jigawa; Uba Sani, Kaduna; Kabiru Gaya, Kano; Baba Ahmed Kaita, Katsina; Mohammed Adamu Aliero, Kebbi; Smart Adeyemi, Kogi; Suleiman Sadiq Umar, Kwara; Oluremi Tinubu, Legọs; Abdullahi Adamu, Nasarawa; Mohammed Sani Musa, Naịja; Ibikunle Amosun, Ogun; Nicholas Olubukola, Ondo; Surajudeen Ajibola, Ọshụn; Teslim Folarin, Ọyọ; Hezekiah Ayuba, Platu; George Thompson Sekibo, Rivas; Aliyu Wamakko, Sokoto; Yusuf A. Yusuf, Taraba; Ibrahim Geidam, Yobe; nakwa Mohammed Hassan, Zamfara. Ndị nnọchịteanya ọgbọnta sineti bụ: Bala Ibn Na'Allah na Ibrahim Shekarau, Nọt-Westị; Kashim Shettima na Lawal Yahaya, Nọt-Ist; Tanko Al-Makura na Yakubu Oseni, Nọt-Sentralụ; Abdulfatai Buhari na Biodun Olujimi, Saụt-Westị; Lilian Uche Ekwunife na Chukwuka Utazi, Saụt-Ist; Rose Oko nakwa Akon Eyakenyi, Saụt-Saụt. Ndị Red Cross akwadola maka Coronavirus Nigerian Red Cross sị na ha nwere ndị ji aka họpụta onwe ha inyere aka ma ọ bụrụ na ọrịa coronavirus mechaa tinye isi na Naịjiria Ngalaba gbatagbata maka ahụike bụ Nigerian Red Cross, ekwuputela na ha agwala mmadụ otu nde ka ha saa anya mmiri maka ịkwụsị mgbasa ọrịa coronavirus na Naịjiria. Abubakar Ahmed Kende bụ odeakwụkwọ ha, kwuru na ha na ụlọọrụ Nigerian Centre for Disease Control na-arụkọ, ịhụ na ha busoro ọrịa agha. Coronavirus adịbeghi na Gana Ndị mba Gana ekwuola na ha achọtaghị ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ abụọ a na-enyochabu maka ya na mba ha. Mmadụ abụọ ahụ bụ otu onye Chaịna na onye Ajentina, ji aka ha gaa ụlọọgwụ ka ha na-arịa ọrịa dị ka o yiri coronavirus tupu e nyochawa ha. Naịjiria nwezịrị naanị pati 18 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (INEC) ewetuola ọnụọgụgụ otu pati nọ na Naịjirịa site n'iri isii na asaa ruo iri na asatọ. Onye kwuru nke a bụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu n'Abuja taa. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 - Inec Trump ga-achiri gawa Onyeisiala Amerịka Donald Trump Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwetere ohere ịchịri gawa n'ihu dịka ndi omeiwu kpebiri na o metaghi ihe a ga-eji chụọ ya n'ọrụ. Ndị sineti Amerịka mere ntuliaka n'abalị Wenezde iji mara ndị kwadoro ka Trump rituo n'ọchịchị maka ebubo nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta boro ya ma jiri mee ya ihe Bekee kpọrọ ""Impeachment"". Ka e mechara ntuliaka a, mmadụ 52 ekwenyeghị ka a chutuo Trump ebe mmadụ 48 kwenyere. Naanị otu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repọblikans, bụ nke Trump nọ na ya, kwenyere ka a chutuo onyeisiala ahụ maka nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta kpebiri na o mere site n'isi Onyeisiala Yụkren nyochawa Maazị Joe Biden na nwa ya nwoke Hunter. Aha ya bụ Mitt Romney. Mitt Romney sị na ọ bụ maka iyi ya nwụrụ n'ihu Chineke mere ya agaghi ahụ eziokwu sị na o bụ asị. Mana, n'atụmatụ ọzọ banyere igbochi nyocha ndị Ụlọ Omeiwu Nta na-eme maka nrụrụaka ha sị na Trump mere, Maazị Romney sị na nke ahụ adabaghị maka ndị Omeiwu Nta emeghị ihe nnile na kwesiri ime maka ya. Nke a pụtara na mmadụ 47 kwenyere ka achụọ ya n'atụmatu ahụ ebe mmadụ 53 si ka ahapụ ya. Atụrụ vootu ndị n'usoro pati, dịka ndị Democrat tụru ka Trump puọ ebe ndị Repọblịkan sị ya nọdụ. Trump nwetere ọchị n'okpuru patị Repọblịkan. Ntuliaka 2020 Trump na-akwado iso zọọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ na ntuliaka a ga-eme n'afọ a. Otu nta vootu ya kwuru na mmeri a gosiri na Trump ga-eturukwa ugo ọzọ. Trump n'onwe ya kwuru na ya ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ n'ụbọchị Tọzde. Etu ndị mmadụ si nabata ya Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia na-aṅụrị ọṅụ maka mmeri Trump n'ụlọomeiwu ukwu. Ha kwuru na nke ahụ gosiri na aka onyeisiala ha dị ọcha. Mana ndị ọzọ kwuru na ya bụ ikpe agazighi nke ọma. Ndị omekome agbatughị ụgbọelu anyị - Ndị uweojii Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ndị uweojii Naịjirịa sị na ọbụghị eziokwu na ndị omekome gbaturu ụgbọleu Helicopter ha na steeti Kaduna. Akụkọ malitere ifegharị n'ụbọchị Wenezde na ndị omekome gbaturu ụgbọelu ndị uweojii oge ha gara ibuso ha agha. Mana Frank Mbah bụ ọnụ na-ekwuru ndi uweojii si na ọ bụ eziokwu na mgbọ tụrụ ya bụ ụgbọelu maka ọ daghị. Ọ sịkwa na ha gburu ihe ruru ndị omekome narị abụọ na iri ise n'agha ụgbọelu ahu gara. Tanker agbaala ọkụ na Legọs. Ọkụ ahụ egbughi mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ Ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs state kwuru na otu ụgbọala bu mmanụ petrol dara ma nwuru okụ na mpaghara Abule Osun na steeti ahụ. Mana onweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ihe mberede ahụ. Ha kwukwara na ndịọrụ ha na agba mbọ ịgbanyụ ọkụ ahụ ma mepee ụzọ ka ndị mmadụ gafewe. Ntuziaka maka akara ekwentị Dr Isa Ali Pantami Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi ekwentị bụ Isah Pantimi enyela ntuziaka ọhụrụ maka akara ekwentị. O kwuru na tupu mmadụ edenye akara akwantị ya, onye ahụ ga-enwerịrị akara njirimara bụ National Identification Number. Pantimi kwukwara na otu onye agaghị enwekarị akara ekwentị atọ bụ nke e debanyere n'aha ya. Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-akpọchị akara ekwentị ọbụla nke onye nwe ya jiri mee ihe ọbụla na-adabaghị n'iwu. Kirk Douglas alaala mmụọ Kirk Douglas na nwa ya bụ Michael Douglas Onye eji ihe onyoonyoo Hollywood mara bụ Kirk Douglas anwụọla ka ọ gbara afọ otu narị na atọ. Kirk Douglas bụ nna Michael Douglas onye bụkwa onye a ma ama na Hollywood. Akwa ọhụrụ ndị 'Super Eagles' Akwa ọhụrụ ndị ụlọọrụ Nike rụpụtara maka ndị otu egwu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naịjirịa na-ekpo ọkụ ebe niile. Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbu bụ ma ọ ka nke ochie mma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: ""Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m"" - Emeka Adindu" afirika-46316036,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46316036,Ipob: Etu ọgụ dara n’etiti ndị uweojii na Ipob siri mee,"BBC Igbo achọpụtala na otu onye uweojii nwụrụ na ọgbaghara mere n'etiti ndị uweojii na ndị otu Ipob n'ahịa Nkwọ Nnewi dị na Nnewi, Anambara steeti.Ọgbaghara a mere n'ụbọchị Nọvemba 23, 2018 oge igwe mmadụ bụ ndị otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) pụtara na-eme ngagharịiwe maka ntuliaka 2019.","Ndị uweojii nọ n'Anambra kwuru ndị otu IPOB were mma merụọ ndị otu ha ahụ BBC Igbo chọpụtara na ikuku egwu ka na-eku na Nkwọ Nnewi ugbua.Oge BBC batara ahịa ahụ ụbọchị Satode, ụgbọala ndị uweojii a gbara ọkụ ka kwụsa. Akụkọ dị iche iche Ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ ndị Ipob gbara ụgbọala ahụ ọkụ. Ụgbọala Ipob gbara ọkụ Ụfọdụ ndị hụrụ mgbe o mere kwuru na ọ bụ ka ndị uweojii mere ka ha chụsasịa ndị Ipob ka okwu dara.Otu onye nọ mgbe ihe a mere gwara BBC sị,""Ndị uwejii bidoro ịgbali egbe elu, mana ndị Ipob agbaghị ọsọ, ha bara ndị uweojii a ọgụ."" Onye ọzọ hụrụ ọgbaghara ahụ kwukwara na tupu okwu daa, ndị Ipob na-agara onwe ha na-achọghị mmadụ okwu.Ha kwukwara na ha ahụghị ngwaọgụ n'aka ha na mbụ. Akụkọ ndị uweojii Ndị uweojii BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ eziokwu na onye otu ha nwụrụ, mana akụkọ na ọ bụ ha chọrọ Ipob okwu abụghị eziokwu. N'ime ozi ha zịpuru na Twitter, ndị uweojii dere na ha agaghị ekwe ka onye ọbụla jiri okwu ọjọọ kewaa ala Naịjirịa. Otu onye uweojii achọghị ka aha ya pụta n'akụkọ a gwara BBC na: ""Ọrụ anyị abụghị ntisa obodo. Ọrụ anyị bụ ịhụ na o nweghị ihe ọbụla ga-eme ka obodo chara ọkụ."" ""Ọ bụ ka anyị na-eme ka ndị Ipob mata na anyị bịara n'udo ka ha bara anyị ọgụ,"" Onye uweojii a gakwara n'ihu jụọ ma ọnwụ mmadụ ọ bụ ihe e ji eme akaja?""Onye e gburu nwere nwunye, nwe ụmụaka. Ọ bụ mmadụ. Ọ bụghị ihe eji achị ọchị."" Ipob sị na ha egbughị mmadụ Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na o nweghị onye uweojii nwụrụ n'aka ndị otu ha n'ime ọgbaghara dara na Nnewi. Powerful sị; ""Gọọmentị Naịjirịa na-achọ ụzọ ọbụla a ga-eji metọọ aha Ipob makana a mara na Ipob bụ otu udo."" ""Ihe anyị mere ụbọchị ahụ bụ ịdọ ndị Igbo aka na ntị maka ntuliaka 2019"". ""Gwa anyị aha onye ahụ nwuru makana anyị mara na onye ahụ abụghị onye uweojii, ọ bụ ndị uweojii ma onye ndị a bụ."" N'otu aka ahụ, Ụkọchukwu Peace bụ otu n'ime ndị na-agbasa ozi otu Ipob agwaala BBC Igbo na ihe mere ha jiri mee ngaghariiwe ụbọchị Fraide bụ maka ị saa anya Ndigbo na mmiri maka ntuliaka 2019. Peace kwusiri ike na Ipob jiri ohere a were dọọ Ndigbo aka na ntị na ihe ga-adị ha mma abụghị ka nwafọ bụrụ onyeisiala maọbụ osote onyeisiala Naịjirịa. Ihe bụ iwe anyị taa - Ụkọchukwu Peace Ndị ihe mere n'ọgbaghara a BBC Igbo chọpụtara na mmadụ dịka CSP Babalola Adewunyi, ASP Michael Duru na Inspector Akinbami Olaniyi merụrụ nnukwu ahụ n'ọgbaghara ahụ.Inspector Olaniyi bụ onye mechara nwụọ n'ụlọọgwụ. BBC Igbo hụrụ ụgbọala ndị uweojii ọbara juru n'ime ya na ọdọ uweojii nke a kpọrọ ""Area Command"" dị nso n'ebe mkpamkpa ahụ kpara. Otu onye uweojii gwara BBC na ọ bụ ụgbọala ahụ ka ha jị ga bute ndị otu ha emerụrụ ahụ.""Ụgbọala nwere mberede okporoụzọ ka e bu ndị na-agbaga ụlọọgwụ. ""Ndị otu anyị nwara ike ha mana onye otu anyị nwụrụ n'ụlọọgwụ."" Ụgbọala ọzọ akụrịsịrị nọkwa ebe ahụ. Nke mere na ọ bụ ụgbọala atọ ka ọgbaghara a metụtara. Akụkọ ga-amasi gị" afirika-46585329,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46585329,Nigeria Election 2019: Ụmụnwaanyi chọrọ ịnapụ Buhari ọrụ ya,"Na ntuliaka 2019, ka ụmụnwoke juru n'ọsọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ụmụnwaanyị achọghị ịgba aka mere ka ihe ruru mmadụ atọ tinyere ụkwụ n'ọsọ ahụ.","Ụmụnwaanyị ndị a meriri na ntuliaka imeụlọ ndị pati ha mere, na-atụanya ịbụ onye ga-achụpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'oche na 2019. Nke a abụghị mbụ ụmụnwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa. Sarah Jubrin zọrọ n'afọ 2011, ebe Comfort Oluremi Sonaiya zọrọ n'okpuru otu pati KOWA na 2015. Cheta na nso nso a, Oby Ezekwesili gwara ọkwọụgbọ ""kwụsị , ka ọ pụọ"" n'ọnwa Jenụwarị afọ a. 1) Eunice Atuejide 2) Olufunmilayo Adesanya-Davies 3) Angela Johnson 4) Rabia Cengiz" afirika-49247327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49247327,"Imo state tourism: Ihe o ji bụrụ ""elelebe ejeghi ọrụ""","Gịnị na gịnị na-agbata gị n'uche mgbe ị nụrụ ""Imo steeti""?","Munachi Abii meriri asọmpi ""Nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa"" nke afọ 2007 Ị jụọ ọtụtụ ndị, ha nwereike ibu ụzọ kwuo ""Rochas Okorocha"" nakwa ihe akpụrakpụ ya, mmiri Ọtammiri nwereike ibu mmadụ, Assumpta Cathedral, na ihe ndị ọzọ dị iche iche. Mana ị ma na ọtụtụ ihe gbasara steeti ahụ bụ sọ mma? Tinye aka gị n'aka BBC Igbo ka anyị kpọga gị ebe ahụ: 1) Ụmụnwaanyị Imo bụ ""olu gbajie boys"" Genevieve Nnaji emeela ejije na Nollywood ọtụtụ afọ Ọ bụghị ihe itu ọnụ, mana otu njirimara ụmụnwaanyị imo steeti bụ mma ha mara nakwa ""ihe ha bu n'ukwu"". Maka ụdịrị mma ha mara, e jirila ha gụọ ọtụtụ egwu, ma mgbe gboo ma ugbua. 'Ụmụnwaanyị anyị kajara akaja' - Charly Boy Ọtụtụ n'ime ha agaala ihe a kpọrọ ""beauty contest"" bụ emume e ji ahọpụta nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa, ma merie. Ị nụla maka Munachi Abii Nwankwo? Kedụkwanụ maka Anita Ukah, Ugochi Ihezue nakwa Ezinne Akudo? Ka ọ bụ ndị nke na-eme ejije; Genevieve Nnaji, Rita Dominic, Stephanie Okereke Linus, Lilian Esoro na ndị ọzọ? Ọ bụ gịnị ka i che mere e ji ekwu na ụgwọ isi ha dị oke ọnụ? 2) Nri ha bụ ""dachịị"" Ị nụla egwu a ""onye na-arịghị ego o ji ọ na-eri ofe Owere?"" Ọ bụ maka etu ofe a si atọwa agba na ụdịrị ihe na-atụ ndụ mmanụ ka mmadụ ji were ya gụọ egwu. E nwere ofe Igbo ọzọ nwere aha obodo? Ofe Owere bụ ofe ndị ""rijuru afọ"" makana a na-akwọ aka esi ya. I riela ofe ụgba/ofe akwụkwọ? I nwereike ijide ụgwọ ma i rie ofe a, makana ị gaghị ama mgbe ị ga-eji rifee afọ gị nakwa ego dị gị n'akpa. Ofe ọkazị? Ụgba kwanụ? Ụlọ ọbụla e nyere gị ụgba a gwọrọ agwọ nakwa/maọbụ nkwọbi na isiewu, mara na ha nabatara gị dịka nwanne. Ụkwa ndị Imo steeti, anaghị achọ ya mma mana ị ga-ericha taa ngajị gị. 3) Ebe ị ga-elepụrụ ụwa gị anya Ọ bụ eziokwu na obodo niile nwere ebe ị nwereike ịgbara anya gị ekeresimesi, mana ị hụla nke dị n'Imo steeti? Ị bịa Imo steeti, gbaa mbọ ruo mmiri Ugwuta nke e ji 'Oguta Lake' mara. Ị ma na mmiri abụọ dị ebe ahụ bụ Ụrashị na Ogbuide na-ezute mana ha anaghị agwọkọ ọnụ? Ọ bụ ihe Bekee kpọrọ ""confluence"", ọ dịghị ọtụtụ n'ụwa. ""M bịa ụwa ọzọ m ga-efe mmiri"" - Ezenwaanyị ferela mmiri Oguta afọ 40 Steeti ole na Naịjirịa nwere ogige ebe ụmụanụmanụ nwereike ịnọsapụ ahụ? Ị garuo Owere, ndị mmadụ ga-egosinwu gị ebe ogige a dị na Nekede. Lee ụmụanụmanụ dị icheiche bi n'ogige ha n'Imo steeti Kedụkwanụ maka Ịbarị Ọgwa ebe a na-erisa na-atasa nri Igbo dị iche iche? Kaọbụ ugwu dị n'Okigwe? Nakwa Ngwu Spring? 4) Akpụrakpụ Rochas: Rochas Okorocha chịburu Imo steeti gbara n'ọnụ ndị mmadụ ọtụtụ oge maka ịkpụ ma ndị a na-enyo maka mpụ na ihe ndị ọzọ Kedụ steeti dị na Naịjirịa ndị isiala mba juru na ya na-abụghị n'Imo steeti? I chee na ọ bụ asị, gaa n'ebe a na-akpọ ""Heroes Square"", ị ga-ahụ Ellen Johnson-Sirleaf chịbụrụ mba Liberia, Jacob Zuma chịburu Saụt Afrịka na ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị mmadụ akpụrụla Imo steeti n'ọnụ maka akpụrakpụ ndị a. 5) Mahadum Steeti ọzọ dị na mpaghara Ala Igbo na-agụ akwụkwọ ka ndị Enugwu steeti bụ Imo steeti. Ọ dị ọnọdụ ka ebe ọbụla i lere anya n'Imo steeti bụ naanị mahadum ka ị ga na-ahụ. Ha nwere Imo State University (IMSU), nwee Eastern Palm University, Federal Polytechnic, Nekede, Federal University of Technology Owerri (FUTO), University of Agriculture, Umuagwo na ebe ọmụmụ ndị ọzọ. 6) Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba Evan Enwerem chịrị dịka gọvanọ Imo steeti tupu ọ gaa Ụlọomeiwu ukwu Ndị Naịjirịa ahụkwala ndị Imo steeti nwere agba n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ndị dịka Sam Mbakwe, aka chịburu Imo steeti ochie, Evan Enwerem chịrị ụlọomeiwu ukwu Naịjiria, Arthur Nzeribe, Pats Acholonu, Chris Anyanwu, Kema Chikwe, Chile Eboe-Osuji bụ onyeisi ụlọikpe mbaụwa, Emmanuel Iwuanyanwu, Kingsley Ozumba Mbadiwe. Alvan Ikoku bụ onye e sere n'elu ego naịra 10 nke Naịjirịa bụkwa nwaafọ Imo steeti nwere agba. 7) Ndị na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị Onyeka Onwenu bụ otiegwu nwere olu ogene Ndị na-eme mmadụ obi aṅụrị a kpọrọ ""entertainers"" na Bekee juputara na steeti a. Ndị dị ka Onyeka Onwenu, Charly Boy, Okey Bakassi, Uche Ogbuagu, Saint Obi, Kanayo O Kanayo, Osita Iheme e ji ""Paw paw"" mara na ndị ọzọ. 8) Egwu Ọyọrịma (""Highlife"") Ndị Imo steeti anaghị achị ma ọ bịa n'ụdịrị egwu ndị Igbo a. Ị nụla ""Arabanko"", ""Obi ejile ekwele m"", ""Ọzọ bụ iwe m"", ""Ọbaraeze"", Echi dịime, na ndị ọzọ? Ọ bụ n'Imo steeti ka ndị na-agụpụta ọnụ ha dịka Dr Sir Warrior, Oriental Brothers, Kabaka mechara gụwa nke ya, Sunny Bobo, Chima Eke na ndị ọzọ na-agụ egwu gụpụtara egwu ndị a wuru ebe niile. 9) Ihe na-amịpụta n'ala Ndị Imo steeti anaghị eji ọrụugbo egwu egwu; ya mere ala ji amịtara ha mkpụrụ ọma. Ọ bụ mkpụrụosisi dịka ụdara, mango, ka ọ bụ nri dị ka akpụ, ụkwa, ụkpaka/ụgba, akwụkwọ nri, kashuu (juputara n'Ọkigwe), mmanụ nri juputakwara n'ala a. A hụkwala mmanụ agbịdị n'ụfọdụ mpaghara steeti a, dịka n'Ugwuta. 10) Omenala Ikeji bụ emume e ji mara ndị Arọ niile nke gunyere Arọchukwu na Arọndịzuọgụ. Emume ndị Imo steeti pụrụ iche. Ihe dị ka ịgba mmọnwụ, Owu, echichi ma nwaanyị ma nwoke, Ikeji Arọ, Ahịajọkụ na ndị ọzọ. Ka ọ bụ egwu ndị dị ka Abiigbo, Ikoro, Ọkọnkọ? Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ 11) Ndị egwuregwu, Ajunwa wụzị onye uweojii ugbua Imo steeti nwere ndị ụkwụ ha bụ sọọsọ egwu dịka Sam Okwaraji, Emmanuel Amunike, Emmanuel Emenike, Kelechi Iheanacho, Kelechi Nwakali na ndị ọzọ. Kelechi Iheanacho: Nna m achọbụghị iji ntị anụ na m na-agba bọọlụ Christy Opara nwetara ọlanchara n'olimpiks nke afọ 1992 ma bụrụkwa nwaanyị kacha agba ọsọ n'ụwa nke afọ ahụ, bụkwa onye Imo. Chioma Ajunwa ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo n'Olimpiks nke afọ 1996 bụkwa nwaafọ Imo. 12) Ụlọndina, oriri na nkwari E lee anya ọfụma, e nwere ike ịchọpụta na ọ bụ Imo steeti ọkachasị Owere kachasị nwee ""hotel"" na Naịjirịa. Site na Concorde, All Seasons, na ndị ọzọ, ebe niile i tụgharịrị n'Owere nwere ụlọndina ndị a. Kedụ ihe ị ka na-eche ịgaru Imo steeti? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45038849,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45038849,Buhari efeela aka njem London ọzọ,Ozi na-eru anyị ntị bụ na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ga-achị Naịjirịa ụbọchị iri Buhari na-agaghị anọ ya.,"O mebeghị otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-eme njem na London echi bụ Tọọsde ebe ọ ga-ezu ike ọrụ ụbọchị iri. Ozi si n'aka onye ndụmọdụ ya bụ Femi Adesina, nke o dere n'akara Twitter onyeisiala kwuru na Yemi Osinbajo ga-achị Naịjirịa n'ụbọchị ndị ahụ. End of Twitter post, 1 Iwu Naịjirịa nke afọ 1999 kwadoro ka onyeisiala nye osote ya ọchịchị mgbe na ọ nọghị na mba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56500835,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56500835,Insecurity in Nigeria: Ịchịgharị ehi so bute nsogbu nchekwa na Naịjirịa - Nnolim Nnaji,Onye nnọchite anya ọgbọnta vootu Nkanu West n'ụlọomeiwu nta bụ Nnolim Nnaji ekwuola na ịchị ehi na-agagharị n'ọhịa so n'ihe butere ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na Naịjirịa.,"Nnoli sị na ịzụ ụmụanụ n'otu ogige nke Bekee kpọrọ 'Ranching' bụ ebe ụwa nọ ugbua. Mana o kwukwara na onye chọrọ ime ya bụ 'ranching' ga-eji ego ọ ga-eji zụọ ala. Nnaji gara n'ihu kwuo na ọgbaaghara niile na-eme na Naịjirịa bụ n'ihi enweghi ọrụ. Ọ sị ""ajọmmụọ na-ewere ọnọdụ n'obi onye ọbụla na-enweghi aka ọrụ"". Nnaji sịkwa na ya kwesiri ike na ""izu ka mma na nne ji"". Nke ahụ pụtara na ọ kwadoro ọchịchị dị n'oke n'oke nke Bekee kpọrọ ""region"". Ọ sị na e bupu ibu gọọmentị etiti bunyere onwe ya na ihe ga-aka mma. Gee ọkpụrụkpụ ihe o kwuru n'uju." afirika-46465177,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46465177,Body Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada,"N'Awada, ndị Wemblys Super Stars Club bụ ndị ama ama makana ha niile gbachara dịmkpa ọfụma site n'ịkpụ ụzụ bụ ihe ha na-eme.","BBC Igbo gara ọdọ egwuregwu ha n'Awada were chọpụta na ndi a abụghị ndị enweghị ọrụ maka ọtụtụ n'ime ha na-arụgasị ọrụ dị iche iche. Ndị Wemblys bụkwa ndị eji ịdịnotu mara, dika ha na-enyere onwe ha aka. Ha gwara BBC na ọtụtụ n'ime ha esiela na-ịkpụ ụzụ gaa mba ofesi. Ihe ọzụ tụrụ BBC n'anya bụ na ọ bụ ndị Wemblys na emepụta akụrụngwa ha ji akpụ ụzụ. Gee ha ntị n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43919914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43919914,Ngwa nwalee: Gịnị bụ tomato n'Igbo?,Akụkọ ga-amasị gị:,"Ụmụnwaanyị ndị Aguleri, Anambra steeti zara ajụjụ: Gịnị bụ tomato n'Igbo?" afirika-48569937,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48569937,Insecurity in the Southeast: Ndi Igbo keenụ nkwucha maka ihe ntụmadị - ADF,Otu dị iche iche na-ekwuchitere ndị Igbo ọnụ ha adọọla ọha na eze aka na ntị ka ha tinye anya na mmiri ma kee nkwụcha maka ịchekwa ndụ ha ma ihe ntụmadị dapụta n'aka ndị ọchịehi.,"Nke a bụ mkpebị ndị otu a n'ọgbakọ ha nwere n'Enugu ụnyahụ. Nke a mechere ka Ohaneze ndị Igbo kpọchara ụdị oku a ụbọchị Fraịde gara aga. Ọgbakọ a nke Ọkammụta Uzodimma Nwala kpokobara kpebiri ihe ndị a n'akwụkwọ ha binyere aka: Ndị tinyere aka n'akwụkwọ a bụ Pof Uzodinma Nwala nke ADF; Chief Emeka Diwe, President Association of South East Town Unions; Professor Elochukwu Amucheazi, Secretary, Igbo Leaders of Thought; Innocent Amadi of Bilie Human Rights Initiative; Hon Abia Onyike, chairman ADF publicity bureau; Prof. Math Aniekwu, secretary, ADF; Oriakụ Fidelis Chukwu, President Igbo Women Assembly; Prince Tony Nwakaeze, Ọgbakọ Igbo Traders of Nigeria; Isaac Onyia, ASETU Enugu state na Comrade Uchenna Madu bụ onye nọchite anya Coalition of Pro-Biafra Organizations."" Lee ihe nkiri anyị Ụmụ Obiligbo: Anyị ejeghị nga na mba ofesi, ọ bụ asịrị Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49705858,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705858,Toilet Posture: Lee ka ị ga-esi ga mposi ọfụma na-achịghị nsị,Igbo na-ekwu na ihe ọbụla dị mma omume kwesiri ka e mee ma ya kapịa ya ọnụ.,"Etu a ka ọ dịkwa gbasara ị ga-mposi. I mana o nwere ka ị ga-esi nọdụ ala ga mposi, ahụ adị gị mma? Nwekwara ka ị ga-esi ga ya, ọ ghasaa gị ahụ. Nwanne kirie ka ị ga-esi nyụpụ nsị ọfụma na-enweghị nsogbu dịka ịchị isi na ndị ọzọ. Akụkọ ndị a ga-amasị gị" egwuregwu-44459898,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44459898,Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ,Ndị ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles menyere ọtụtụ ndị mmadụ obi aṅụrị ka ha buliri iko nke Olimpiks n'afọ 1996.,"Ndị mmadụ ka na-echeta ya ruo ugbua, ọkachasị etu ha si merie mba Brazil nakwa mba ndị ọzọ e ji bọọlụ mara. Ndị a nọ n'ihe nkiri a gosiri obi aṅụrị ha site n'ijije ihe mere tupu ndị Super Eagles emerie ma bulie iko ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43638014,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43638014,Ronaldo egosịla ihe o jiri bụrụ onye egwu a na-atụ ụjọ,"Cristiano Ronaldo nyere goolu eji amaatụ ụnyahu ka Real Madrid gbakarụ Juventus ahụ n'agba nke ato nke Champions League mgbe ọ gbara ọnụ goolu azụ were nye ya bụ goolu na ihe ndị Bekee na-akpọ ""bicycle kick"".","Cristiano Ronaldo enyela goolu na asọmpị 10 kwụ onwe ya n'azụ N'asọmpị ahụ, Ronaldo pụtara ka onye mbụ nyere goolu na asọmụnpị Champions League 10 so onwe ha na azụ. Ndị Juventus nwere ohere i nye goolu nke ha na ọkara nke mbụ na asọmpị ahụ, agbanyeghị na ọfọrọ obele ka Toni Kroos enyekwara ndị Madrid goolu mgbe bọọlu ya kpịara na igwe goolu. Mana, oge ruru mgbe Dani Carvajal gbanyere bọọlu elu nye Ronaldo, bụ onye wulịlị elu were jiri ike nye goolu Gianluigi Buffon, bụ nche goolu Juventus, ahụhụ anya. Goolu ahu dị egwu, nke mere ndị otimkpu Juventus were kulie ọtọ nye Ronaldo ekene. Marcelo mechiri akwụkwọ mgbe o pịanyere bọọlụ Ronaldo nyere ya na goolu." afirika-44458537,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44458537,Juun 12: Ị ma na ndị Igbo soro lụọ ọgụ a?,"Dika e mere emume itunye MKO Abiola ugo pụrụ iche taa n'ihi mmeri o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993, ụfọdụ echefuola na ọtụtụ ndị Igbo soro mee ụghara iji mee ka ọchịchị ndịagha mejupụta ebumnobi ndị Naijiria tụnyeere ya votu.","Ọkaiwu Olisa Agbakọba so na ndị lụrụ ọgụ Juun 12 Ilu Igbo na-ekwu, 'A lụchaa ọgụ, ụmụnwaanyị enwere akụkọ'. Ọtụtụ ndị ala anyị chefuru na ọtụtụ ụmụafọ Igbo dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmentị, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye (activists) na ndị ntaakụkọ tinyere oge ha, akụ ha nakwa ije ụkwụ ha, ebe ụfọdụ gara mkpọrọ n'ihi okwu gbasara Juun 12. Ndị Igbo so lụọ ọgụ Juun 12 Ọtụtụ ndị Igbo so lụọ ọgụ Juun 12 dị agụta agụta mana ndị aha ha na-ada ụda n'ọgụ ahụ gụnyere ndị a: 1. Humphrey Nwosu: Onye isioche ngalaba gọọmentị na ahụ maka ntulika nke a kpọrọ 'National Electoral Commission of Nigeria (NECON)' onye onyeisiala Naijiria oge ahụ bụ Ibrahim Babangida, tinyere n'ọrụ bido n'afọ 1989 rue 1993. Ọ bụ Nwosu haziri ntuliaka Juun afọ 1993 nke e kwuru na ọ bụ ya bụ ntuliaka kacha kwuru ọtọ na nke niile emegoro na naijiria. Nwosu palitere 'Option A4' nakwa 'Open ballot'. 2. Ndubuisi Kanu: Onye chịbụrụ dịka Gọvanọ Imo steeti nakwa Legọs steeti n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo dịka onye agha. Ka ọ lachara ezumike nka, Kanu so n'otu ndị lụrụ ọgụ maka Juun 12 nke a kpọrọ NADECO. 3. Olisa Agbakoba: Onye bụbụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkaiwu Naijiria bụ 'Nigeria Bar Association (NBA)' na bekee sọ n'otu n'ime ndị Igbo kara aka soro na mbọ Juun 12. Agbakoba jiri otu o hibere bụ 'Civil Liberties Organisation (CLO)' 4. Arthur Nwankwo: Onyeisi Eastern mandate Union ma bụrụkwa osote onyeisioche NADECO. A tụrụ ya mkpọrọ maka okwu gbasara okwu a. 5. Ralph Uwechue: Nwafọ Igbo larala mụọ bụ onye bụbu onyeisi otu Ohaneze Ndigbo. Uwechue onye bụbụ onye nochite anya naijiria na mba Liberia so na Ndigbo gbara mbọ Juun 12 6. Ralph Obiora: Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama dọnyere ukwu na Juun 12. 7. Ebitu Ukiwe: Ọ nọrọ dịka osote onyeisiala Naijiria n'oge ọchịchị Ibrahim Babangida site n'afọ 1985 rue 1986. Ka Ukiwe onye bụ onye Abiriba n'Abaịa steeti lara ezumike nka o soro n'otu ndị lụrụ ọgụ maka Juun 12. Ihe ndị mmadụ kwuru Otụtụ ndị mmadụ dịka Confidence na-ekwu na ọ bụrụ na-ewepụ Humphrey Nwosu, n'okwu juun 12 abụghị okwu a ga-na-ekwu taa n'ihi na ọ kpọrọ ndụ ya asị n'ime nke a. Emeka Jerome toro Buhari maka ikwanyere MKO Abiola,Kingibe na Gani ugwu, ma kwuo na ọ dị mma ka ọkwanyere Humphrey Nwosu ugwu maka ị bụ onye na-akwụba aka ọtọ. Na mkparịtaụka ha na BBC nwere, ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu na-egosi obi aṅụrị maka nturuugo gọọmentị nyere Moshood Abiola na Gani dịka 'GCFR' nakwa 'GCON"". Mana n'otu aka ahụ, ha gosiri mwute na e chefuru ndị Igbo soro lụọ ọgụ ahụ. Onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye chịburu dịka onyeisi otu jikoro ndị ọkaiwu n'Onitsha bụ Obele Chuka Chuka kwuru: ""Nke a bụ mbụ m nụrụ ụdịrị akụkọ ndị be anyị tụnyere yabụ Abiola akwụkwọ rienne karịa etu ndị Igbo si atụnyere ndị yoruba zọrọ ọchịchị akwụkwo. ""Ndị Igbo sokwa na ịkpọ ganigani bụkwa ihe ririnne. Mmadụ dịka Ndubuisi Kanu, Ralph Uwechue, Olisa Agbakoba, Ralph Obiora..."" N'okwu ya, otu ochie dike na ntaakụkọ bụ Abuchi Anueyiagụ kwupụtara ọṅụ ma ntunye ugo e mere MKO Abiola , matụọ arịrị na ndị Igbo soro lụọ ọgụ n'okwu Juun 12 dịka Humphrey Nwosu onye ha siri ntuliaka Juun 12 na Arthor Nwankwo onye 'tunyere ego' ya n'mbọ ahụ na e chezọrọ ha." afirika-44197280,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44197280,Ndị uweojii achụsasịala ndị Ipob n'Awka,"Ndị uweojii jiri anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị otu chọro ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa bu IPOB n'ebe ndị otu Ohanaeze Ndigbo na-ahazị nzụkọ ha akpọrọ ""South East Summit on Restructuring of Nigeria"" n'asụsụ Bekee taa.","Ndi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka Ndị Ipob kwubụrụ na ha akwadoghị nzuụko a, na ihe ha chọrọ bụ nkewa site na Naịjirịa ebe ndị Ohanaeze chọrọ nhazi Naịjirịa. Onye ntaakụko BBC Igbo no n'ebe a na-eme nzụkọ kwuru na ndị IPOB chọbụru ibanye ebe a na-eme ya bụ nzụkọ ga-yasasia ihe a na-eme, maọbụ kwụsị ndị mmadụ ịbanye ebe ahu kpam kpam , mana ndị uweojii ruru 500 nọ n'ọrụ nchekwa n'ebe ahụ ekweghi. Ha gbaliri egbe elu ma tụo anwụrụ anya mmiri i ji chụsasịa ndị Ipob ahụ. Ugbu a, nzụkọ ahụ na-aga n'ihu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51178111,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51178111,"Mbaka Prophecy: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru",Ụkọchukwu na-elekọta 'Adọration Ministry' Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya nọ n'ụlọ ekpere ya na-erighi nri ọbụla ganye na Ụlọikpe Ukwu ekwuo na Hope Uzodimma emeriela dịka gọvanọ Imo Steeti.,Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma Fada Mbaka onye guzobere ụka ịtụ mmamma maka mmezu amụma o buru ụbọchị 31 nke ọnwa Decemba 2019 kwuru na obi dị ya mma na Hope bụ onye ga-azọpụta ndị Imo steeti. Ọ gwara ndị Imo ka ha nye Hope afọ abụọ nke ọ ga ejị dozigharịa obodo ahụ. Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepụ aka ka ha si akọ ya ọnụ na Soshal midia n'ihi na amụma ya na ebụ bụ ọ natara chi ọbụghị nke a kpara akpa. Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa media-52326017,https://www.bbc.com/igbo/media-52326017,Coronavirus Tips: Ọ bụghị eziokwu na ndịọrụ gọọmentị na-ebufe ndị mmadụ coronavirus,Gọọmentị Legọs kwuru na ha ga-amalite ịga n'ụlọ n'ụlọ inyocha ndị a na-eche na ha nwere ike ibu ọrịa coronavirus.,"Mana akụkọ malitere iwu na soshal midia bụ na ọ bụ ndịọrụ gọọmentị na-ekesa ndị mmadụ ya bụ nje. Nke a bụ okpotokpo asị. Ọzọ, ọbụghị mmadụ niile ka a na-enyocha maka ọrịa, ka ọ bụ ndị e chere na ha na ndị nwere covid-19 mekọtara ahụ, maọbụ ndị bi n'ogbe ebe ndị nwere ya bụ ọrịa buru ibu. Biko gbaara akụkọ ụgha ọsọ." afirika-43865297,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43865297,'Ekwela ka Igbo nwụọ',Onye ritere ihe nrite dịka onye bụ ọkachasị n'ide akwụkwọ na Naịjirịa n'afọ 2017 bụ Ikeogu Oke ekwuola na asụsụ Igbo agaghị anwụ ma ndị Igbo kpọọ ya mkpa.,"Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ ""Nigerian Prize of Literature"" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ “The Heresiad”. Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem. Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Maazị Oke kwuru okwu gbasara nchekwa asụsụ Igbo, na onye o chere na o kwesịri ịdị n'aka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49584522,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49584522,Rochas Okorocha: EFCC anatala ikike ịjichi akụnaụba Okorocha na nwunye ya,"Ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ ekwuola na ha anatala ikike ịjichi akụnaụba Rochas, nke nwunye bụ Nneoma nakwa nke nwa ya nwaanyị.","Onyeisi ụlọọrụ ha n'Enugwu bụ Usman Imam gwara ndị ntaakụkọ nke a dịka ọ na akọwa ka ha si rụọ ọrụ n'ọnwa asaa gara aga. Ha kwukwara na ha jichiri ụlọ ozọ nke otu Paschal Obi bụbu onye enyemaka Okorocha na nwa ya nwaanyị. Imam kọwara na ha malitere nyocha Rochas na ezinaụlọ ya ma kwuo na ha ga-azara ọnụ ha n'okwu a. Ihe ndị ha jichiri gụnyere ụlọ-obibi ruru asatọ, otu ụlọ oriri, ụlọakwụkọ abụọ, ụlọahịa nakwa otu ụlọọgwụ. Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo ""Anyị na-agbalị ịnapụta ihe ndị a n'aka Okorocha kpam kpam ma nyeghachi ya ndị Imo steeti"" ka o kwuru. Akụkọ ga-amasị gị Ụmụada Enugu state 'na-eweta ọkụ' na Nigeria Ọgbaghara na mwakpo agaghị azọpụta gị Bello - PDP" afirika-48541293,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48541293,8th Assembly: Ihe ise a ga-eji cheta Ụlọ omeiwu nke asato,"Dika ụlọ omeiwu nke asatọ ga-abịa n'isi njedebe taa bụ Tọọzdee abalị isii nke ọnwa Juun, 2019, ka anyị leghachị anya n'ihe olemole ndị megasịrịnu na ya bụ ụlọ omeiwu nke ekwesiri ncheta. 1. Iwu kachasị n'ọnụọgụgụ","Senate President Bukola Saraki and House Speaker Yakubu Dogara Ụlọ omeiwu nke asatọ bụ nke ọnụọgụgụ iwu ha mepụtarala kachasị kamgbe Naijiria malitekwara ọchịchị onyekwuouche ya n'afọ 1999. Bido mgbe ha malitere ọrụ n'abalị itoolu nke ọnwa Juun afọ 2015, ụlọ omeiwu nke asatọ (nke ukwu na nke ata) emepụtala iwu dị narị iri isii na iri anọ na anọ (644), dika ndị otu Policy and Legal Advocacy Centre (PLAC) si depụta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyelarị aka na iwu iri anọ na asatọ n'ime ha mee ka ha soro n'iwu obodo Naijiria, mana ọtụtụ n'ime ha ka ọ jụrụ ibinye aka. 2. Osote onyeisi si na pati nke nta: Nke ọzọkwa bụ n'ụlọ omeiwu nke asatọ ka ọ nọ mee, bụ nke izizi osote onyeisi ya si n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-abughi ndị nọ n'ọchịchị wee pụta. Ọtụrụ ndị mmadụ n'anya mgbe Ike Ekweremadu tuuru ugo dịka osote onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na-agbanyeghi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke o so na ya abụghi nke kachasị nwee mmadụ n'ụlọ omeiwu ma bụrụ ndị nọ n'ọchịchị. N'aka nke ọzọ, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki, bụ onye isi omeiwu nke izizi na Naijiria nke e boro ebubo nrụrụaka ma kpụpụ ya ụlọikpe ka ọ ga zara ọnụ ya. Ụlọ ikpe mechara sị ya laa na ikpe amaghị ya. 3. Nghọtahịe ha na onyeisiala: A ga-echetakwa ụlọ omeiwu nke asatọ dịka nke ha na onyeisiala kachaa nwee nghọtahịe. Nke a nwere ike bụrụ maka na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) akwadoghị ọchịchị Bukola Saraki na Yakubu Dogara bụ ndị isi ụlọ omeiwu nke ukwu na nke nta. Nghọtahịe a dị n'etiti ndị omeiwu na onyeisiala biara mee ka usoro iweputa atụmatụ mmefu ego, nke Bekee kpọrọ 'budget', na-egbu nnukwu oge. Ekweremmadu na Saraki 4. Ndị omekome wakporo ogige ndị omeiwu: Ihe ọzọkwa kwesiri ncheta bụ mgbe ndị omekome wakporo ụlọ omeiwu ukwu n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Eprelu 2018 maburu akara ikikere ha nke a kpọrọ 'mace' n'asụsụ Bekee. Ndị uweojii mechara kwuo na ha chọtara ya bụ akara ikikere n'okpuru akwa okporoụzọ dị n'Abuja. Ndị omekome wakporo ogige ndị omeiwu ukwu n'ọnwa April 2018 maburu akara ikikere ha. 5. Mwepụta atụmatụ a kpọrọ 'Not too young to run': Ọbụkwa ndị ụlọ omeiwu nke asatọ mepụtara iwu nke belatara afọ ole mmadụ ga-agba tupu ya azọ ọchịchị na Naijiria. Dịka iwu ọhụrụ ahụ si dị, onye ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naijiria, maọbụ gọvanọ steeti, maọbụ onye otu ụlọ omeiwu ukwu, ga-agbarịrị afọ iri atọ na ise. Iwu nke ochie kwuburu na mmadụ ga-agba iri afọ anọ tupu ọ zọọ ọkwa onyeisiala. Ọzọkwa, onye chọrọ ịga ụlọ omeiwu nta maọbụ ụlọ omeiwu steeti, ga-agba afọ iri abụọ na ise, ọbụghịzị afọ iri atọ dịka iwu nke ochie si kwuo. Ihe ndi mmadu na-ekwu soshial midia Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ụlọ omeiwu nke asatọ gbalịrị nnọọ nke ọma, mana ụfọdụ ndị ọzọ ekwetaghị nkea. @nzewigodwin kwuru na ụlọ omeiwu nke asatọ bụ ọkaibe @ElaborJoel1 kwukwara na Saraki nakwa Dogara mere nke ọma na afọ anọ ha nọrọ n'ochịchị @Henryblaze50 kwuru na ọbụrụ ihe ule, ụlọ omeiwu nke asatọ gafere ule nke oma. Mana @olusegunmaiye sị na ya achọpụtaghị ihe ọbụla ndị isi ụlọ omeiwu etiti mepụtara. @ajoseganiyu kwukwara na-onweghi ihe ọbụla bara uru ụlọ omeiwu ukwu meputara karia mpụ na nrụrụaka. Ndị omeiwu mere ihe ha kpọrọ ""Valedictory Session"" taa. Lee ka o si gaa:" afirika-54801540,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54801540,Nsukka Mosque: A chabiri ihe onyonyo Bishop Godfrey Onah n'ụdị o ji riri ghọọ ihe ọzọ- Nsụkka Catholic Diocese,Ụka Katọlik nke Diayọsis Nsụka ekwuola na ihe onyonyo Bishop Godfrey Igwebuike Onah nke na-efegharị na soshal midia nke ụfọdụ na-arụ aka sị na ọ bụ ya butere ọgbaghara mere e jiri gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ na Nsụka bụ nchabi ka a chabiri ya n'ụdị ka ọ ghọọ ihe ọzọ.,"Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ 'Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee nọrọ na nso nso a degarala onyeisi ndị uweojii Naijiria nakwa Onyeisi ndị uweojii nzuzo(DSS) akwụkwọ mkpesa sị ka e jichie Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Rt Rev Godfrey Onah. NSCIA na ndị Ụka Alakụba ụfọdụ weliter isi na-ebo Onah ebubo ikwu okwuchukwu kpaliri mwakpo ndị okpukerechi Alakụba na ụlọụka ha n'Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Ndịda-Ndịda(South-South). Onye enyemaka mgbasaozi Gọvanọ Umar Abdullahi Ganduje nke Kano stteeti bụ Salihu Tanko Yakasai kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị ọrụ nchekwa jiri Onah kuziri ndị ọzọ ihe. site na ịnwuchie ya ma kpụpụ ya ụlọikpe. Mana mkparịtaụka Odeakwụkwọ dịayọsis ahụ bụ Rev Fada Cajetan Iyiobi na BBC Igbo nwere n'ekwentị, o kwuru na a dụkọrọ ihe onyonyo ahụ n'ụzọ mere ya ka nghọta ya dị iche na ihe Bishop kwuru. Ọ sịrị, ""O nwere ahịrịokwu ị ga-ekwu, mana ewepụ ya etu isi kwuo ya mana ewepụ ya etu isi kwuo ya ọ pụta ihe ọzọ."" 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere' ""Ndị a gara were akụkọ ebe a kpọtara ụka Kraistị na ụka Alakụba aha wepụ, hapụ ihe ekwuru na mbụ nakwa ihe e kwuru na ikpeazụ."" Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ n'otu ya bụ ookwuchukwu ka Bishopụ Onah kpọrọ ndị ntorobia oku ka ha ghara itinye aka na tigbuo-zọgbuo nakwa imebi ihe ọbụla. N'okwu mkpesa otu NSCIA kpesara ma kpoo oku ka a nwụchie Onah, Fada Iyiobi kwuru na Ụka Katọlik adịbeghị njikere ịsa ya bụ okwu. "" Mgbe anyị dịrị nkwadebe anyị ga-agwa ndị ntaakụkọ."" Ka nke na-eme, otu 'Muslim Rights Concern'(MURIC) esonyela na-akpo okpu ka anwụchie Bishọpụ Onah. Onyeisi otu ahụ bụ Ishaq Akintola kwuru na ịnwụchi Onah ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ndu ụka ga-achọ iji ụlọụka mere ebe ha na-akpalite ọgbaghara aka na ntị. Nsukka Mosque: Ọgbaghara Nsụka abụghị banyere okpukperechi- Onyeisioche Ọkpuru Ọchịchị Nsụka Onyeisioche okpuru ọchịchị Nsụka bụ Cosmas Ugwueze agbaala ama na mmadụ anọ merụrụ ahụ n'ọgbaghara mere na Nsụka ahapụla ụlọọgwụ ebe Ndị uweojii tọhapụrụla ndị anwụchiri maka ya bụ okwu. N'ụbọchị Satode,abalị 30 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, ọgbaghara dapụtara n'Odenigbo-Nsuka nke mere na e merụrụ ụfọdụ ndị mmadụ ahụ ma gbaa ụlọụka ndị na-ekpe ụka Alakụba ọkụ. Okwu ahụ ghọrọ okwu a kpụ n'ọnụ dịka ụfọdụ maliete ịkpọ ya ọgbaghara dị n'etiti ndị Ụka Kraistị na ndị Ụka Alakụba. Mana Ugwueze kwuru na ọgbaghara enweghị ka o siri emetụtaghị okpukperechi ọbụla. ""O nweghị onye dunyere ha gaa mee ihe ha mere. O nweghị ihe gbasara ụka n'ihe . Ọ bụ ndị na-ese okwu ego njem."" ""Onye Igbo na-anya Keke butere nwaanyị onye Awusa buru ya rue na Barracks Junction. Onye ya N100, onye Keke si na ihe ha abụọ kpebiri bụ N150."" Nwaanyị tie mkpu, ndị be ha gbaputa tiwe onye keke ihe, ọbara si ya isi na ọnụ na-apụta."" Ọ kọwara na ọ bụ ụmụ Igbo hụrụ ihe mere, ""weziri iwe webiga ya oke were gaa mebiwe ihe."" ""Anyị gbara mbọ buga mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ. Gọọmenti amalitela ịrụgharị ụlọụka Alakụba "" Ugwueze gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, udo alọghachiela na mpaghara ahụ. Kepụkepụ BBC Igbo nwetara na-ekwu na a nwụchiri ụfọdụ ndị Ugwu nakwa ndị Nsụka maka ọgbaghara ahụ mana a tọhapụla ndị a nile. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu bụDavid Ndukwe ekweghị aza ekwentị ya iji gwa anyị nke bụ eziokwu. Na mkparịtaụka nke ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde, Ugwueze kwuru na ọ bụ nghọtahịe dị 'etiti onye Igbo na-anya keke na nwaanyị onye Ugwu na-ere tomatọ banyere keke ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ha agbanyụọla ya bụ ọkụ dịka ha kpọtara ndị ọrụ bụghị mmadụ anọ bụ ihe merụụahụ bụ Nsukka Mosque: NSCIA edegarala onyeisi ndị uweojii Naijiria mkpesa Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị uweojii na Sa'ad Abubakar, onyeisi otu Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee edegarala onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu akwụkwọ na-ebo Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Bishop Godfrey Onah ebubo ikwu okwu butere mwakpo ndị okpukerechi Alakụba nsogbu na Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Niaja Delta. Otu ahụ na-ebo Onah ebubo ikwu okwu butere ọgbaghara mere ka awakpo ndị ụka Alakụba na Nsuka na nsonso a. Na akwụkwọ mkpesa nke Osote odeakwụkwọ NSCIA nke Salisu Shehu binyere aka, ha kwuru na ụfọdụ ndị ụka Kraistị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsụka gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ dịka Bishọpụ Ona gbaschara ozioma ya. Ozi ahụ kwuru sị, ""N'Ụbọchị Satọde abalị 31 nke ọnwa Ọktoba, ụfọọ̄ụ ndị ụka Kraịstị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsuka, gbaa ụlọ Alakụba ha ọkụ n'ihi okwuchukwu nke jụpụtara okwu akpọmasị,asị nke otu Bishọpụ odfrey Igwebuike Onah ziri."" Ha gara n'ihu boo ebubo na ọ bụ okwuchukwu ya kpalitere ndị ụka ya ịwakpo ndị ụka Alakụba nakwa ụlọụka ha. Akwụkwọozi nke NSCIA zigara onyeisi ndị uweojii Gịnị na-esere ndị alakụba na ndị obodo Nsụka? Lee ihe anyị chọpụtara Ebe ya bụ mkpamkpa ọgụ nọrọ dapụta ụbọchị satọde gara aga bụ na ogige obibindị nchekwa dị nso n'Odenigbo Nsukka. BBC mere nchọpụta na ihe kpatara ya bụ nsogbu bụ na onye ụgbọala keke na onye o bu bụ nwaanyị awụsa bụ onye ofufe alakụba nwere nhọtahie, nke kpatara na ụmụnne nwaanyị ahụ were mma makasịa onye keke ahụ. Dịka Imam na elekọta Central Mosque Nsukka Barracks bụ Yakubu Abdulahi Omeh siri kọwaa, ndị otu ya bụ onye Keke na ndị ntorobịa Nsukka chere na onye Keke ahụ anwụọla nke mere ha jiri wakpo ndị niile bụ ndị Hausa ụbọchị ahụ ma tiwe ha nnukwu ihe. Ha gbakwara ụlọ ofufe ndị alakụba abụọ dị ebe ahụ ọkụ ma mebisia ụlọ akwụkwọ. Otu Onye Keke bu Okechukwu Ome kwuru na ha chere na onye keke ibe ha anwụọla nke kpatara ha jiri mebiwe ihe ndị alakụba ahụ. Ọ kọwara na nwaanyị ahụ bụ Aisha kpọrọ ndị moslem bịara maa onye keke mma n'ihi na ha nwere nyọtahie maka ụgwọ njem ya. Onye Ugwu bi na Nsúka sị na o nweghị esemokwu dị n'etiti ndị Ụka Kraistị na ndị Ụka Alakụba Ihe emebiri gunyere ụlọ ndị Alakụba abụọ agbara ọkụ, ụlọ akwụkwọ ndị na-ekuzi maka Islam nakwa ọtụtụ akwụkwọ na akụrụngwa ha ji ekpe ekpere. Bishop ndị katọliki na Nsukka bụ Bishop Onah eburularị ụzọ yọọ ndị ntorobịa ka ha hapụ imebisi ihe ma ọ bụ gbuo onye ọbụla n'ihi na omegidere iwu nke chukwu.Nnukwu ọgụ ahụ dara na Nsukka ụbọchị ole na ole gara aga n'etiti ndị okpukperechi nke Kraịst na nke alakụba abịala na njedebe mana e mebiri ọtụtụ ihe. Mbọ BBC gbara inweta ọnụ ndị uweojii amịtaghị mkpụụ n'ihi na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ David Ndukwe azaghị ekwentị ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ralph Uwazuruike : Ihe ọ sara Nnamdi Kanu maka ngaghariwe End SARS" afirika-43621347,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43621347,Leah Sharibu: Anyị aghaghị ekwu okwu- Ndịagha Naịjiria,Ọnụ na-ekwụchịtere Boko Haram bụ Brig-Gen Jude Texas Chukwu ekwuola na ndịagha Naịjirịa agaghị ekwu okwu banyere nwa Dapchị ka nọ n'aka ndị Boko Haram bụ Leah Sharibu.,"Ụmụakwụkwọ Dapchi a tọrọ ji ndụ ha lọta Chukwu sị: ""A gaghị ekwu okwu maka Dapchị n'ihi na okwu ahụ dizi gọọmentị n'aka."" Cheta na BBC Igbo na Aisha Wakil, bụ onye a na-akpọ 'Mama Boko Haram', gwara BBC Igbo na nwaada ahụ ga-alọta na mkparịtauka anyị na ya nwere. O kwukwara na akwụghị gọọmentị etiti ụgwọ iji tọpụ ụmụaka Dapchi ha tọrọ. BBC Igbo gbara mbọ ịnụta onu ndị gọọmentị Naịjirịa, mana onyeghị onye n'ime ndị na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari anyị nwetara. Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Leah Sharibu bụ otu n'ime umụaka 101 ndị Boko Haram tọọrọ na obodo Dapchi n'ọnwa Febụwarị. Mmadụ 105 n'ime ụmụaka alọtala, mana ha kwuru na ise n'ime ha nwụrụ n'ụzọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44009404,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44009404,Atọghapụla Dino Melaye ị ga-ụlọọgwụ,Akụkọ na-ekwu na atọghapụla Melaye ebe ọ nọ n'ụzọ njem a ga ụlọọgwụ n'Abụja.,Dino Melaye Onye nọchịtere anya ya na ụlọịkpe bụ Mike Ozekhome bụ onye rịọrọ ụlọikpe ahụ sị tọghapụ Melaye maka ị nata ọgwụgwọ zuru oke. Ọ bụ onye ọkaịkpe ukwu nke ụlọikpe ahụ na Lokoja nyere iwu a ka eburu ya ga ụlọọgwụ nke dị n'Abuja ebe ngwa ọgwụgwọ zuru oke adịghị n'ebe eji ya. Cheta na Dino wuchiri n'ụlọịkpe n'elu akwa ndịna n'izuụka maka ahụ adịghị ya na mbido izuụka a. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-55451659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55451659,Ndị Ọwụwa Anyanwu kwesịrị iji ọjị na mmanya gaa rịọ nkwado Tinubu maka 2023 - Joe Igbokwe,"Onye bụbu ọnụ na-ekwuru patị All Progressive Congress (APC) na Legọs Steeti bu Maazị Joe Igbokwe ekwuola na ndị Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị iburu mmanya, were ọjị gakwuru Bola Ahmed Tinubu ma rịọ ya ka o kwado otu onye n'ime ha maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.","Bola Tinubu na Joe Igbokwe Maazị Igbokwe kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo a na-akpọ ""Okwu Akpụ N'Ọnụ"" nke e mere n'ehihie Mọnde. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ọchịchị Naịjirịa ruru na 2023, mana ha kwesịrị iji nwayọ gwakwuru ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara dị icheiche ma rịọ ka a kwado ha. Igbokwe gakwara n'ihu kwuo na uche ya na-agwa ya na Tinubu bu n'obi ịzọ oche onyeisiala na 2023, mana ọ bụrụ na ndị Igbo gakwuru ya rịọ ya, o nwere ike ịhapụ ịzọ, ma kwado onye Igbo Dịka Igbokwe si kwuo, ""Tinubu ehiwela akụrụngwa eji achụnta vootu na mpaghara niile na Naịjirịa, ọ bu sọsọ Chukwu nwereike gbanwe obi ya."" ""Jirinu ọjị na mmanya nkwụ ọcha gakwu ya,"" nke a ka Igbokwe kwuru Ọ sị na atụmatụ iji mmanya na ọjị gakwu Tinubu bụ makana ọ bụ odogwu n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchi ma bụrụkwa onye ga-abara Ọwụwa Anyanwụ uru n'okwu achụmnta vootu na 2023. ""Ọ bụ Tinubu bu na Buhari meriri n'afọ 2015, nakwa afọ 2019."" 2023 bụ ohere ỌwụwaAnyanwụ Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe Maazi Igbokwe na Ọkaiwu Jimmy Abia - bu onye sokwa na mkparịtaụka ahụ - kwenyere na ndi Ọwụwa Anyanwụ achịbeghị Naịjirịa n'ụdịrị Onyeisiala mbụ. Nke a, dịka ha siri kọwa, bụ maka na agaghị agụnye Nnamdi Azikwe n'ihi na ọ bụghi ya bu onyeisiala n'oge ha, dịka Aguiyi Ironsi bụ onye agha n'oge nke a. Jimmy Abia sị ebe ọbụla e siri lee ya anya, ọ bụ ndi Ọwụwa Anyanwụ ka o ruru. Agbanyeghị nke a, Ọkaiwu Abia sị na ihe a ga na-ekwusi ike bụ na-achọrọ ""Onyeisiala si Ọwụwa Anyanwụ"". Ọ sị na ihe mere nke a jiri di mkpa bụ na ụfọdụ nwereike kuwe Igbo ma chezọọ na ọbụghị sọso n'Ọwụwa Anyanwụ ka Igbo gbara akwara. ""Onye Igbo si 'South South' ekwesighi ịpụta makana Goodluck Jonathan esirila mpaghara ahụ chịa Naịjirịa. E nwere ọtụtụ ndị tozuru ịchị Naịjirịa n'Ọwụwa Anyanwụ Maazị Igbokwe sị na-anaghị achọ onye tozuru ịbụ onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ. Ọ si na ya ma mmadụ iri tozuru ọfụma ọzọ ọchịchị ma kwuo na ọ dị mkpa ịrụ akwa gaa mpaghara ndị ụzọ. Ihe mere mkparịtaụka jiri dị mkpa Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu Jimmy Abia kwenyere n'ihe Joe Igbokwe kwuru gbasara mkparịtaụka n'etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ. Ọ sị na nke a dị mkpa maka na sọsọ vootu si Ọwụwa Anyanwụ agaghị emenwu mmadụ ka ọ bụrụ onyeisiala. Ọkaiwu Abia sị: ""Anyị ga-esetị aka ka anyị na ndị ọzọ kwekọrịta maka atụmatụ a."" Cheta na pati APC kwuburu na ha ga-enye ndị ndịda Naịjirịa ohere ịchị Naịjirịa ma Onyeisiala Buhari rịtuo." afirika-45485095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45485095,Achịcha Bekee: Ihe kpatara ọnụ ego ihe eji eme ya ji ria elu,Otu onye n'ime ndị na-emepụta achịcha bụ Patience Akpuru-Egwuwa ekwuola na ihe kpatara ọnụ ego ihe e ji emepụta achịcha ji rịa bụ maka oke ntụkwasị obi ụmụ Naịjirịa nwere n'ihe a na-ebubata Achịcha Bekee: A ga-ebuli ọnụ ego ya? ebubata.,"Ndị na-ere achịcha na-enwetakarị ezigbo ego na ya O kwukwara na o tela eji e bugo ọnụ ego ihe eji eme achịcha na Naịjirịa nke kpatara na achịcha bekee dị ọnụ karịa etu ọ dị na mbụ. Gere ihe o kwuru ebe a n'uju: Ọnu ego ihe eji eme achịcha na-agabli elu oge ọbụla. Ọnụ ego achịcha nwere ike ịrị elu n'oge na-adịghị anya dịka otu a kpọrọ ""Premium Bread Makers Association of Nigeria"" sị kwuo. Ha kwuru na ntaramahụhụ oke ọnụego ihe e jị emepụta achịcha bekee na-ada n'ahịa na-ewetere ha emetụtala etu ha sị emepụta ya bụ achịcha. Onyeisi ha bụ Jemide Tosan kwuru na kamgbe afọ atọ, ọnụego ihe e ji emepụta achịcha ji wee riwe elu, e nwebeghị ka ọ si hara n'ọnụ ego ihe a na-ere achịcha ugbua. O kwuru na ọ bụrụgodu mgbe ọnụ ego mmanụ ụgbọala rịrị elu, ""achicha bekee ji persenti 11 wee ria."" Achịcha bụ otu nri ụmụ Naịjirịa na-erikarị N'okwu ya, ụfọdụ n'ime anyị na-aga ebịte ego n'ụlọ akụ ka ha wee kwudosie ike na ya bụ azụmahịa mmepụta achịcha nakwa iji wee hụ na ha apụghị n'ahịa. Tosan kwuru na etu ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị otu ha enweghị ihe ha nwere ike ime ma na abụghị ibuli ọnụ ego achịcha bekee nke ga-emetụta ndị onweghị ka ọha ha. Ihe eji emeputa achịcha rịa elu, ọnụ ego achịcha na-arịkarịelu ozigbo ""Anyị na-ekwe nkwa na anyị ga na-enye ụmụ Naịjịrịa achịcha zuru oke ma na-edozi ahụ ọfụma."" Lee ihe osise gosiri ọnụ ego Achicha bekee gbalitere kamgbe afọ atọ. Ọnụ ego achicha bekee arịala kamgbe 2015 Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47610127,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47610127,Election 2019: E meghi ezigbo ntuliaka n'Abia Steeti - Alex Otti,Alex Otti ji aha pati APGA zọọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti ekwuola na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ jụpụtara na nrụrụaka.,"Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Otti kwuru na ndị ọtụ INEC na ndị nchekwa rụrụ PDP ọrụ. Ọ gara n'ihu kọwaa na mpụtara ntuliaka ahụ abụghị ihe ndị mmadụ tụtara na vootu. Otti kwuru na dịka ọ dị ugbua, na ndị otu ya ka na-eme nyocha iji kpebie ma ha ọ ga-aga n'ụlọikpe maa mpụtara ahụ aka. Gee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-52128137,https://www.bbc.com/igbo/media-52128137,Covid-19 n'otu nkeji: Akpụrụachịa ọ na-achụ ọrịa coronavirus?,"Maka ndị na-ekwu na mmanya ọkụ na-achụ coronavirus, kpachapụkwa anya gi o.","Mmanya ọkụ anaghị agwọ ọrịa ọbụla ma ya fọkwa coronavirus. Lee ihe nkiri a ka i were anya gị hụ. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi" afirika-51383055,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51383055,"Anambra state: Tank mmiri adagbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Nkpọr-agu, Anambra state",Ọdachi dakwasara ụmụaka abụọ si be nne na nna ha gawa akwụkwọ n'ụtụtụ Wenezde ka nnukwu ugbommiri Bekee kpọrọ tank mmiri juru na ya dakwasara n'elu ụlọakwụkwọ ha.,"Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed si dee, ya bụ arụ mere mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ, na Royal Kings Foundation Nursary and Primary School dị na Nkpor-Agu nke dị n'okpuruọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti. Dịka o si kọọ, ya bụ ugbommiri dị galọn 800 si n'ụlọ dịketere ụlọakwụkwọ ahụ dabata n'ime ụlọakwụkwọ were dakwasa n'elu ụlọakwụkwọ ahụ. Nke a metụtara ụmụakwụkwọ anọ bụ nke ebu gawa ụlọọgwụ Idemili dị na Nkpor, bụ ebe mmadụ abụọ n'ime ha nọ nwụọ. Mmadụ abụọ ahụ bụ Wisdom Ezewudo gbara afọ atọ nakwa nke nwaanyị gbara afọ abụọ bụ nke amatabeghị aha ha ugbua. Mmadụ abụọ ndị ọzọ na-erubeghị afọ abụọ na-anabata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ka ọ dị ugbua. Ndị uweojii ka na-enyonye anya n'ihe butere ọdachi a. Ụgbọelu ndị njem akpọkasịala na mba Turkey Otu ụgbọelu bu mmadụ 171 chipuru n'ụzọ ya kpọkaa n'ala n'ọdọụgbọelu dị n'Istanbul, isiobodo mba Tọki. Ya bụ ụgbọelu kụjara ụzọ atọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na otu ahụ. Enweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede mere na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị 2020, dịka Minista na-ahụ maka njem bụ Mehmet Cahit Turhan kwuru. Gọvanọ steeti ahụ bụ Ali Yerlikaya sị na mmadụ 21 ahụ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Ya bụ ụgbọelu ndị njem nke ndị Pegasus Airlines si ọdịda-anyanwụ mba ahụ bụ Izmir bata Istanbul ka oke mmiri na-ezo. A kpọpụtachara ndị nọ na ya bụ ụgbọelu gụnyere ndị ọrụ ha mmadụ isii, na ndụ. Ihe nkiri ndị mmadụ na-eke na soshal midia gosiri ọkụ na-agba n'ime ụgbọelu a, mana ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara menyụọ ya ozugbo. 'Snow' ekpugidela mmadụ 38 Ndịagha na ndị obodo ahụ na-enyere aka ịzọpụta ndị 'snow' kpugidere n'ụgbọala ha Mmadụ iri atọ na asatọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ iri ọzọ na-eche ka a gbatara ha ọsọ enyemaka dịka nnukwu snow dara ọzọ ma kpuchite ha n'ugwu dị na mba Tọki. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ narị atọ na-agba mbọ inyere ndị mmadụ aka, dịka a na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị ihe a gburu nwereike ịrị. Maka ụmụnwoke 47 a na-ekpe ikpe mmekọrịta Ụlọikpe dị na Legọs eyigharịkwaala ụbọchị ha ga-ekpe ikpe dimkpa nwoke iri anọ na asaa e boro ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke ibe ya n'ezi. Ọkaikpe nọ n'elu ikpe ahụ kwuru sị na ọ ga-akụpụ ikpe ahụ mgbe ọzọ ha ga-agbakọta ma ọ bụrụ na ndị gbara dimkpa ndị a akwụkwọ akpọtaghị akaebe ga-eme ka ikpe a gaa n'ihu. Fada Mbaka na-abara Emeka Ihedioha mba Imo state: ""Ihedioha nwere ike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya"" - Mbaka Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba. Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: ""Ihedioha kwado ịga mkpọrọ"" - Fada Mbaka Ighalo na Manchester United Odion Ighalo gbabuuru Naịjirịa bọọlụ akọwaala ihe mere o ji kwere isi Shanghai Shenhua dị na Chaịna bịa ịgbara Manchester United bọolụ. Ighalo kwuru na ọ bụ maka etu o si anụ ya ọkụ n'obi mere o ji kwere ka Man Utd ghara ikwuzu ya ụgwọ, ma ya bụrụ na ọ gbaara ha bọọlụ. Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị Ọnụahịa ịkpọ oku nakwa izikọrịta ozi n'ekwentị agbagoola. Nke a bụ maka na ụlọọrụ ekwentị amalitela ịna ụtụisi VAT pasentị asaa na ụma ise maka oku ọbụla ha kpọrọ nakwa ozi ọbụla ha ji ekwentị zipu. BBC Igbo chọpụtara nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ya bụ ihe malitere iwu na soshal midia Twitter. Ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu maka ya bụ ihe, na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa. Iji maa atụ, ozi 'sms' a na anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT. Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Janụwarị. Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'value added tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise. Iwu ahụ malitere n'uju n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị a. Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi Anambra steeti enweela ụlọikpe mkpegharị Gọvanọ Anambara bụ Willie Obiano Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti emgheela ụlọikpe mkpesa ọhụrụ n'ọka. Nke a bụ nke mbụ Anambra steeti ga-enwe ụlọikpe mkpesa kamgbe afọ iri abụọ na itoolu e kewara steeti ahụ na Enugu. Obiano kwuru na ihe kpatara ọchịchị ya ji malite ịrụ ya bụ ụlọikpe mkpegharị bụ iji belata oke mgbagharị ndị ọkaiwu steeti ahụ na-agbagharị n'okporo ụzọ. O kwuru na ọ bụ n'Enugwu ka a na-ebuga ikpe niile si Anambra steeti maka mkpegharị. Na Lesotho Taa ka a ga-amalite ikpe nwunye praịm mịnịsta mba Lesotho bụ Maesaiah Thabane ikpe maka ebubo igbu nwunye di ya. Ndị uweojii Lesotho na-enyokwa praịm mịnịsta ahụ enyo maka ọnwụ nwunye ya nke mbụ bụ onye ya na ya na-esebu okwu. Maesaiah gbaburu ọsọ gbaga mba Saụt Afrịka nke mere ka ndị uweojii Lesotho wepụta aha ya dịka ọnye a na-achọ achọ. Mana a nwụchiri ya ụbọchị Tuzde oge ọ gara kpee onwe ya n'aka ndị uwe ojii. Otooto C Ronaldo Ụwa niile kpụ Cristiano Ronaldo n'ọnụ ugbua dịka ọ na-eme emume ncheta afọ iri atọ na ise ya. Ọtụtụ na-ajụ mmụọ na-akụrụ Ronaldo egwu nke o ji akpa ike niile ọ na-akpa n'egwuregwu bọọlụ. Onye bọọlụ ọzọkwa na-eme ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị Wenezde bụ Neymar nke mba Brazil. Trump na Pelosi Pelosi dọkara akwụkwọ ozi Trump e nyere ya Obi akpọ dị n'etiti onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Nancy Pelosi dịka ọ na-akawanye njọ. Ha abụọ gosiri ụwa niile n'ụbọchị Tuzde na ha esighi otu ụzọ aga. Trump gara ụlọomeiwu ịgwa ndị Amerịka okwu nke a kpọrọ 'State of the Union, mana ọ jụrụ ikwe Pelosi n'aka. Pelosi n'onwe ya dọriri akwụkwọ okwu Trump nke e nyere ya. O kwuru na onweghi otu mpụrụ eziokwu ọ hụrụ n'ime ya. Trump ekweghi Pelosi n'aka N'okwu ya, Trump kwuru na ọchịchị ya emeela ka Amerịka nwee ugwu ọzọ. O kwuru na ihe ruru nde mmadụ asaa nwetara ọrụ kamgbe ya banyere n'ọchịchị. Oge Trump na-ekwu okwu, ndị otu pati ya bụ 'Republican' nọ n'etu ya aha, ma na-ekwu na ọ ga-achị afọ anọ ọzọ. NLC adọọla gọọmentị etiti aka na ntị Onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba Otu jikọrọ ndịọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' adọọla gọọmentị etiti aka na ntị ka ha ghara ịkpatụ ego e ji akwụ ndị lara ezumike nka ụgwọ aka. Onyeisi otu a bụ Ayuba Wabba kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde n'ihi kepukepu a na-anụ na gọọmentị etiti chọrọ igbaziri tarị Naịra abụọ n'ime ego 'pension'. Ayuba kwuru na anya NLC dị n'ego 'Pension' ahụ maka na ọ bụ ọbara na ọsụsọ ndị ọrụ. O kwuru na gọọmentị ka ji ndịọrụ lara ezumike ụgwọ ruru narị ijeri naịra anọ (N400 billion). 'Customs' anwụchiela nde dọla asatọ Onyeisi 'Customs' bụ Hameed Ali na-egosi ego ahụ ha jichiri Ngalaba na-ahụ maka mbubata na mbupu ngwaahịa na Naịjirịa bụ 'Customs' ekwuola na ha jichiri nde dọla asatọ na ụma bụ nke ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bupu na Naịjirịa. Onyeisi Custom bụ Hameed Ali gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ n'ọnwa Janụwarị ka ya bụ ihe mere. Ali kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu dị na Legọs n'ihi ya bụ okwu. Ọ kọwara na ọ bụ ndị ekperima, ndị na-ebu ọgwụike maọbụ ndị nrụrụ aka na-achọkarị ụzọ ibupu ego n'ụzọ di otu ahụ. Ali dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla na-eme njem ịpụ na Naịjirịa gbaa mbọ hụ na ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ma ọ bụrụ na o ji ihe karịrị puku dọla iri n'akpa ya. Ụmụaka Liverpool enwetala mmeri Otu egwuregwu bọọlụ Liverpool agafeela n'agba nke ise nke FA cup oge ha ji otu ọkpụ goolu merie Shrewsbury Town n'abalị Tuzde. Mmeri a tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na Liverpool ji naanị ụmụaka wee gbaa ya bụ bọọlụ maka na ndị nnukwu nọ ezumike. Ro-Shaun Williams nke Shrewsbury nyere onwe ha goolu na ya bụ asọmpi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: International Cancer Day: ""Chineke zọpụtara m n'aka ọrịa kansa"" - Anwuli Ojogwu" afirika-55399251,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55399251,Ọgba mbọ: 'Inyere ụmụnwaanyị aka mere m ji malite ụlọọrụ ime isi',"N'agbanyeghi na ọ mụghị etu e si eme isi maọbu wig, Chinyere Anigbo bụ dọkịnta ahụike gbanyụrụ ọkụ n'ọrụ ya wee malite ịrụpụta wig.","Taa, ọ na-ebu wig ya aga mba ụwa dị iche iche. O nwere ndị ọrụ karịrị narị anọ ọkachasị n'ụmụnwaanyị, ọ sị na ọ bụ iji nyere ha aka mere o ji malite ọrụ ịrụpụta ntụtụ a na-ekpu ekpu bụ wig. N'akụkọ a, ọ kowara etu o si malite nakwa etu o si aga. Ọ bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo tinyere aka mee akụkọ a" afirika-43760419,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43760419,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ: 'Ndigbo saanụ anya mmịrị na 2019',Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ndị ""NGO"" akpọọla ndị Igbo ka jikere maka 2019 Ndị NGO arịọla ndị Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ntuliaka Ndị otu nọọrọ onwe ha a kpọrọ NGO na bekee arịọla Ndịgbo ka ha doo anya n'ala chọwa ihe dabara mmiri na ntuliaka nke 2019. Jude Ohanele bụ otu n'ime ha kwuru nke a na ọgbakọ Situation Room nwere n'ụbọchị Tuusde rịọrọ ka onye Igbo ọbụla ruru ogo kawa ahụ gbata akwụkwọ ntuliaka. Sinetị Naịjirịa sị sị chụọ ndị Sineti Naịjirịa e nweghịzị okwukwe n'ebe ndị isi ọrọ nchekwa nọ Ụlọomeiwụ ukwu bụ Sịnet akpọọla Onyeisiala Buhari oku ka ọ chụọ ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria niile n'ọrụ. Ha kpọrọ oku a maka oke ogbugbu mmadụ ka na-aga n'ihu n' obodo dị icheiche na Naịjirịa.. Barbara Bush alakwurula ndị nna ya ochie Barbara Bush bụ nwaanyị a ma ama n'ihi okwukwe ya Barbara Bush, nwunye onye bụbu onyeisiala Amerịka nakwa onye na-alụ ọgụ ikwado agụmagụ anwụọla n'afọ iri itoolu na abụọ (92). Bush bụ nwaanyị si n'ezinaụlọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-adị mma nke wepụtara onyeisiala Amerịka abụọ - di ya bụ George H. Bush na nwa ya nwoke bụkwa George .W. Bush. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa: N'egwuruegwu Man. U bụ ndị nke abuo ebe Bournemouth bụ ndị nke iri na otu na okpokoro ligi Ndị Bournmouth na Manchester United ga-akwarịta mpi taa n'elekere isii nke mgbede. Man U emeribuola Bournemouth ugboro abuo n'ime isii ha sọburu mpi. Ebe ka ha nọ n'okpokoro ligi? Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa: Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ihe ise ị kwesiri ịme tupụ ị bu ezigbo otiegwu - Phyno" mba-uba-43442726,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43442726,Russia: Mmadụ 23 ndị ọrụ UK ka Moscow chụpụrụ,Mba Russia ekwuola na ha ga-achụla ndị ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta mba Britain na ndị ọzọ mmadụ iri abụọ na atọ dịka nsogbu dị n'etiti mba abụọ ahụ na-aga n'ihu maka mwakpo a wakporo otu onye nyocha nzuzo nke mba Russia na nwa ya na UK.,"E kwuru na nsị enyere Sergei na nwa siri ike karịa onye na-abụghị gọọmenti kwadoro Ụlọọrụ mba Russia na-ahụ maka mmekọrịta ndị mba ofesi ekwuola na ndị ọrụ mba Britain ahụ nọ n'isi obodo Russia bụ Moscow ga-ala n'otu izuụka. Ha kwukwara na ha ga-emechi ụlọọrụ ndị Britain bụ ebe ha na Russia sị ekekọrịta omenaala na ejije, ya na ebe ndị mba Britain bi na Russia dị na St Pitasbug. Nke a bụ ịzaghachi mba Britain maka ndị ọrụ Russia mmadụ iri abụọ na atọ Britain chụlara. Britain nyere iwu ka ha laa maka ihe ahụ mere ụbọchị anọ ọnwa a bụ Maachị nke gọọmenti UK na-ata gọọmenti Russia ụta mana Russia gọnarịrị ihe ọjọ ọbụla. Ụlọọrụ UK na-ahụ maka mmekọrịta ndị mba kwuru na ha tụrụ anya ihe a Russia mere mana ndị ọrụ nchekwa dị n'aka ga-enwe ọgbakọ n'izu na-abịa ka ha mara ihe ha ga-eme ọzọ. N'akwụkwọ ha dere, ha kwuru: ""Ihe Russia mere agbanweghị na chọrọ igbu mmadụ abụọ n'ala UK nke a na-enweghi okwu ọzọ na-abụghị na mba Russia ka ikpe mara."" Onye nyocha nzuzo ahụ bụ Sergei Skripal na nwa ya nwaanyị bụ Yulia Skripal ka nọ n'ụlọ ọgwụ dịka a hụrụ ha n'oche na Salisbury ebe ha amaghị onwe ha. Sergei Skripal afọ 66, na nwa ya Yulia dị afọ 33 nọ n'ọnọdụ dị egwu n'ụlọ ọgwụ Ụbọchị Fraide, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọrịta UK na mba ndị ọzọ bụ Boris Johnson kwuru na ""ihe niile na-atụ aka"" na ọ ga-abụ aka na-achị mba Russia bụ Vladamir Putin nyere iwu ka a wakpoo mmadụ abụọ ahụ. Na ịzaghachị, onye nkwuchiteọnụ Putin bụ Dmitry Peskov kwuru na ebubo ahụ tụrụ ha n'anya ma na ha agaghị agbagha ya. Nke a niile na-abịa dịka ndị mba Russia na-akwadọ ime ntuliaka onyeisiala. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44573750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44573750,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Super Eagles ọ ga emeri Aisland?,Ihe ndị dị mkpa n'ụtụtụ a,"Agbara Ekweremadu akwụkwọ na ụlọikpe maka ebubo ịma ụma leghere anya n'idepụta akụ na ụba ya na 2015 Omeiwu Ike Ekweremadu na Eyinnaya Abaribe etinyerela ọnụ na ebubo onyeisiala Buhari boro ndi omeiwu na ha kapụrụ ego e ji aru ọrụ dị mpka mgbe ha hazigharịrị Bojeti afo a. Ekweremadu kwuru na ịrụchapụ ọdọ ụgbọelu Enugwu na ngalaba ndị ọzọ dị ya na ndị omeiwu ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mkpa. Sineto Abaribe na onwe ya sị na ọ tụrụ ha n'anya mgbe ha nụrụ maka nkapụ ego a, ma kwuo ndị omeiwu ala Igbo ga-eme nzụkọ gbata gbata maka okwu a. N'ebe ọzọ na Naịjirịa, Ndị Shiite n'Abuja ji akwụkwọ El-Zakzaky ebe ha na-agagharị Akuko na-eru anyị ntị bụ na otu onye uweojii anwụọla na Kadụna steeti ebe ndị shi'hites ji okwute magbuo ya. Agbakwara ụfọdụ ihe ọkụ n'gbaghara dara ebe ndị ofufe shi'hites ahụ mere ngagharị iwe maka onyeisi ha anwụchirị kemgbe 2015. El-Zakzaky: Ndị Shi'ite egbuola otu onye uweojii na Kadụna Na mba ofesi, Akpụpụla nwunye onyeisiala mba Israel bụ Sara Netanyahu ịkpe maka ebubo mpụ na-ekwu na o jị ego gọọmentị kwụọ ụgwọ nrị o gotere. Nwunye Netanyahu agọọla ebubo ndị a ebe ịkpe ahụ jisike aga nihu na Jerusalem. N'egwuregwu, Taa ka anyị ga-ama ma Naịjirịa a ga alata maọbụ gaa ihu na njem ị bụlata ikomba ụwa Super Eagles ga-ezute Aisiland n'ọgbọ egwuregwu Volgograd ma ọ kụọ elekere anọ nke ehihie Ọ bụghị nke ụwe mara mma, dee nuu chapleti na mmiri. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49131206,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49131206,Enugu-Ezike tragedy: 'Ọnwụ ụmụokoroọbịa nwụrụ n'ọmị mmiri na-ewute anyị',"Ndị obodo Igogoro, Enugu-Ezike dị n'okpuruọchịchị Igboeze Nọt, n'Enugu steeti, ka na-eru uju ụmụ ha nwụrụ n'ime ọmị mmiri.","Otu n'ime ha gwara BBC Igbo na iwe na-ewe ya makana ọ bụ ụmụokoroọbịa ike juru n'ahụ nwụfuru etu ahụ. Ha kọwara etu ụmụokoroọbịa ahụ si wee na-agba mbọ ebe a na-egwu ntọala e ji arụ ụlọ, tupu ọdachi a adakwasị ha. Cheta na akụkọ pụtara ụbọchị Mọnde bụ Julaị 22, 2019, na ụmụnwoke asatọ nwụrụ n'ime ọmị mmiri ka ha gara ịzọpụta otu onye dabara n'ime ya." afirika-54368518,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54368518,Nigeria Independence Day: 'Ọ bụ ndị agha naara ọchịchi n'ike butere nrụrụaka na Naịjirịa'- Mbazulike Amechi,Mbazulike Amechi bụ onye bidoro oge ọ dị nanị afọ iri na asatọ were soro zọwa nwereonwe Naịjirịa.,O kwuru etu ha siri bido Zikist Movement ma etu ndị Briten siri tụọ ụfọdụ n'ime ha nga. Ọ bụ na Zikist Movement ka o si banye otu party NCNC. Gụọ ihe o kwuru maka etu ọ sị nsogbu soro bido n'ọchịchị Naịjiịa. afirika-46742077,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46742077,Nigeria Election 2019: Nwaanyị ọ ga-emecha chịa Naịjirịa?,Sọọsọ ụmụnwoke na-achị ala Naịjirịa kemgbe ha ji nweta mwereonwe ha.,Oge nwaanyị ga-achị obodo Naịjirịa o ruola kaọbụ o rubeghi? Kedụ mgbe ọ ga-abụ? Kedụ ihe na-egbochi nwaanyị ịchị Naịjirịa? Lee ihe ndị Igbo kwuru. 42871597,https://www.bbc.com/igbo/42871597,Patience Jonathan adapụtala n'ikpe ya na EFCC,"Ụlọ ọka ikpe ukwu nke gọọmentị etiti di na Abuja,ekwetala ijụ ikwusi ulọ ọrụ n'ahụ maka inyocha mpu ego na nrụrụaka n'inyocha nwunye onye bu bụrụ onye isii ala Naijirịa, Patience Jonathan.",Patience Jonathan soro di ya me emume mgbere ntụliaka n'afọ 2015 Onye ọkaikpe ukwu akpọrọ Justice John Tsoho wepuru ya bụ ikpe Patience kpọro 'mwakpo mgbe ọbụla'. Patience Jonathan mara ndị EFCC iwu ijeri naira abuọ(N2Billion Naira) na n'ọnwa June afọ 2017 maka imebi ikike diri ya. EFCC gbakwara akwukwọ nke ha iji me ka kachie ya bụ ikpe maka na ọ lara niyi usọrọ ikpe. EFCC gwara ulo ikpe na ha machiri akautu Patience maka nchọpụta zuruoke gosiri ego na-ezighi ezi nabata na Akautu ya. Justice Tsoho kwesiri ike na onweghị ihe aka ebe gbara ọkpụrụ kpụ gosiri na EFCC wakporo Patience Jonathan. afirika-44527352,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44527352,Akụkọ kachasị na-abalị: Ụlọikpe atụọla Ralph Uwazuruike mkpọrọ,Ralph Uwazuruike ga-aga mkpọrọ,"Otu ụlọikpe na Owere tụrụ Ralph Uwazuruike bụbụ onyeisi otu na-achọ ị nweta onwe ha akpọrọ Massob mkpọrọ otu ọnwa makana ọ jụrụ ị bịa zaa ọnụ ya n'ụlọ. Mana okaiwu Uwazuruike kwuru na mkpebi a gbagwojuru ha anya makana ha ka na-arịọ ụlọikpe nọ n'Abuja arịrịọ banyere ikpe a. Otu ahịa na Benue agbaala ọkụ Anya hụrụ ihe mere kwuru na ụlọ ahịa ruru otu narị lere n'ọkụ a. Ọnụ na-ekwuchiri gọọmentị Bauchi steeti kwuru na ọ hịara ahụ ị mmenyụ ọkụ a makana ụzọ ị ga yabụ ahịa adịghị mma ncha ncha. Ụgbọ oloko gburu mmadụ atọ na London Ndị uweojii kwuru na ugbua, ha agaghị enwe ike ikwu ka ihe a siri mee. Ha kwukwara na ha ka na-eleba anya na yabụ ihe. Ọkara nke iko mba ụwa N'Egwuregwu, Sweden meriri South Korea otu ọkpụ na asataghị ihe n'asọmpị ha taa n'iko mba ụwa. Belgium jiri goolu atọ merụọ Panama ahụ n'asọmpị ha. Tunisia na England ga-asụ mpi nke ha n'elekere asaa nke abalị a. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Fidelis Ilechukwu bụ onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ MFM sị na obi ume ala dịkarị mkpa n'idu ndị mmadụ." 45544741,https://www.bbc.com/igbo/45544741,Linda Ikeji amụọla nwa mbụ ya,Linda Ikeji bụ onye nwe ihe e ji agbasa ntaakụkọ dị icheiche amụọla nwa mbụ ya n'ụlọọgwụ na mba Amerịka n'ụbọchị 17 nke ọnwa Septemba 2018.,"Linda Ikeji agwabeghị ndị mmadụ ihe ya na-amasị onye bụ nna nwa ọhụrụ ya End of Instagram post, 1 Linda depụtara afọ ojuju ya n'ozi o dere n'akara soshal midia nke Twitter ya. N'ọnụ ya ""Chukwu nna, abụrụla m nne. Baby J abịala ụwa, a mụrụ ya taa."" Ndị mmadụ jisiike ekele ya ma na-asị nwa ya nnọọ. Amabeghị ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị ka ọ mụrụ, mana a na-anụ kepu kepu na ọ mụrụ nwoke. Cheta na Linda gbawara 'internet' mgbe akụkọ pụtara na ọ dị ime, ebe rue ugbua, amagbeghị onye tụwara ya ime. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47295368,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47295368,Nigeria Election 2019: Etu ndị akaọrụ mbiputa si erite uru n'oge ntuliaka,Kedụ ndị ka erite uru ma oge ntuliaka ruo?,"BBC Igbo sogharịrị ndị akaọrụ ha bụ ibiputa ihe, ha kọwara etu oge ntuliaka si bụrụ oge ha kacha eri. Makana ha sị na ndị ndọrọndọrọ na-ebuputere ha nnukwu ego iji achụ nta vootu, ọ na-eme ka nnukwu ego na-abanye n'akpa ndị na-ebiputa okpu, akwa, ọkọlọtọ nakwa ihe ndị ọzọ ha na-eke ndị mmadụ." afirika-46190829,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46190829,Nigerian Police: E gburu ụmụaka abụọ ma tụnye ha n'ime igbe njụoyi,Ndị uweojii ejichiela otu nwoke a kpọrọ Michael Ede bị n'Ikorodu dị na Lagos iji nyere ha aka n'ịchọpụta onye gburu ụmụ ya abụọ.,"E nwetara ozu ụmụ abụọ ndị a dị afọ isii na afọ anọ n'ime igbe njụoyi dị n'ụlọ ya. Dịka Ede onye gara mee mkpesa n'ogige ndị uweojii siri kọwa, ya na ụmụ ya kpochiri ụzọ laba ụra n'abalị, mana n'etiti abalị oge ọ gara ịnyụ mamiri, ọ hụzighị ụmụ ya. Ọ chọwara ha ma hụ ozu ha n'ime igbe njuonyi. N'okwu ya, onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Lagos state bụ Chike Otih kwuru na ndị uweojii nwuchiri nwoke ahụ iji nyere ha aka ime nyocha banyere okwu a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47684158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684158,Igbo Language: Gịnị bụ 'Umbrella' n'asụsụ Igbo?,Ụfọdụ mkpụrụokwu asụsụ Igbo na-efu nwayọ nwayọ.,Ya mere BBC Igbo ji ajụ ndị mmadụ ihe a na-akpọ ụfọdụ ihe n'Igbo. Lee ihe ha kwuru gbasara nke Bekee kpọrọ 'Umbrella'. 43021751,https://www.bbc.com/igbo/43021751,Ndị uweojii anọ n'ime ndị 'ọchụehị wakporo' efuola,Ndị uweojii na Benue steetị na-akọwa na ndị otu ha anọ na-efu efu kemgbe ndị ha na-eche na ha bụ ndị ọchụehi wakpochara ha ka ha nọ n'ọrụ nchekwa.,"Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Benue bụ Moses Yamu, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara maka ndị ntaakụkọ. Ọ sị na ọ nọ na Logo, bụ mpaghara ime obodo steeti ahụ ọgbaghara na-eme ka ihe a mere. Ọ si, ""Ka anyị na-eme ngagharị iji gosi na anyị na-echekwa obodo etu o siri masị, ndị otu ọrụ anyị a na-kpo 'Police Mobile Force Team' gara Ayilamo nke dị na Logo LGA. Mana, ka ha na-alọta ebe ha na anọ, ndị ọchụehi bu egbe wakporo ha. Otu n'ime ụgbọala ha ji arụ ọrụ gbara ọkụ ka mwakpo a na-eme."" Cheta na ndị ọkọụgbo na ndị ọchụehi na Benue steeti nwere nsogbu, nke butere igbu mmadụ na imebi akụnụba dị icheiche." afirika-43616137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43616137,Mama Boko Haram: Naịjirịa akwụghị ụgwọ ọbụla iji gbapụta ụmụ Dapchi,"Aisha Wakil, nwaanyị Igbo na-alụ onye Ugwu a ma dịka 'Mama Boko Haram' gwara BBC Igbo na o nweghi ego ọbụla Gọọmenti etiti kwụrụ iji gbapụta ụmụaka Dapchi.","Ihe Aisha Wakil kwuru na mkparịtaụka a mere ọnwa ole na ole gara aga kwụnyere n'ihe Lai Mohammed bụ mịnịsịta ọrụ mgbasaozi dị n'aka kwuru. Na ọsịsa nyocha otu UN mere nsonso a nke kwuru na ego si aka fere aka, Mohammed sị o nweghị ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ maka mgbapụta ụmụ Dapchi. Lee mkparịtaụka Mama Boko Haram na BBC Igbo nwere: Akụkọ ga-amasị gị: Ka amara E megharịrị atụmatụ ajụju ihe nkịrị a n'ebe ọzọ abụghị ebe emere ya na mbụ." afirika-44869250,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44869250,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Enwebeghị onye mere mkpesa maka ebubo e boro Adeosun - Uweojii,Isiokwu ndị dị mkpa n'ụtụtụ a,"Ebubo Kemi Adeosun Ndị mmadụ echefuola maka ihe gbasara ebubo mmerụaka asambodo ndị NYSC e boro Kemi Adeosun bụ minista na-ahụ maka ego na akụnaụba Naịjirịa? Adeosun ṅụrụ iyi ọrụ dịka minista n'afọ 2015 Ka ụbọchị ole na ole e boro ya ebubo a gachara, ndị uweojii ekwuola na ha agaghị enyochanwu ya bụ ebubo maka na enwebeghị onye bịara mee mkpesa n'aka ha. Jimoh Moshood bụ onye na-arụ ka osote kọmishọna ndị uweojii gwara onye ntaakụkọ Punch na ndị uweojii amaghị maka ebubo a. Ọ sị ""Anyị ga-enwetarịrị mkpesa, nke e dere ede maọbụ jiri ọnụ kwuo. Ị ga-edegara ụlọọrụ ndị uweojii nke divishọnal maọbụ Kọmishọna uweojii maọbụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa niile akwụkwọ; anyị anatabeghị mkpesa ọbụla, ya mere anyị agaghị enyochanwu ya."" Ndị Ide mmiri metụtara Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agaruola Katsina ileta ndị oke ide mmiri mekpara ahụ. Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ ebe ụlọ ruru narị ise mebiri ma mee ka ihe ruru mmadụ puku ise ghara inwe ebe ha ga-edewe isi. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Osibanjo gara Kastina maka ide mmiri Nelson Mandela Ọ dị ndụ taa, Nelson Mandela bụ onye ji onwe ya chụọ aja maka nwere onwe ndị a na-akpa oke agbụrụ ma bụrụkwa aka chịbụrụ mba Saụt Afrịka, gaara adị afọ otu narị taa. Mandela nwụrụ n'afọ 2013 oge ọ dị afọ 95 Mana ụfọdụ ndị ntorobịa Saụt Afrịka BBC gbara ajụjụọnụ maka ndụ ya na-akatọ ụfọdụ ihe ndị o mere oge ọ dị ndụ. N'egwuregwu Wayne Rooney dị afọ iri atọ na abụọ ekwuola na o kwetara ịgbara otu DC United nke Amerịka bọọlụ maka na ọ chọghị ịbụ ibu nyịrị danda nye otu Everton. Rooney gbaara Everton afọ atọ, 2002-2004 na 2017-2018 Cheta na Rooney gbaara otu Manchester United bọọlụ afọ iri na atọ. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu" afirika-43787357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43787357,Ndị uweojii: Atọọrọla onye mba Jamini na Kano,Ozị ndị uweojii Kano Steeti wepụtara na-ekwu na ndị na amaghị nsị ha bụ bu egbe gburu onye uweojii na-echekwa otu nwafọ mba Jamini tupu ha tọọrọ nwoke ahụ.,"Ndị uweojii na-ahụ maka nchekwa obodo Ihe a mere n'ụbọchị taa bụ iri na isii n'ọnwa Epurelu mgbe ọfọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke ụtụtụ a n'okporo ụzọ Sabon Titi Madobi dị na Kano. Ha kwuru na mmadụ ise bu egbe nọrọ n'ụgbọala gbachiri ugbọala bu ndị ọrụ Dantata and Sawoe Construction Company ihu malite na-agba ha egbe. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị mwakpo a gburu otu onye uweojii ngalaba Special Protection Unit (SPU) na-echekwa nwafọ mba Jamini akpọrọ Michael Cremza na-arụ n'ụlọọrụ ahụ. Kọmishịọna ndị uweojii na Kaneọ Steeti bụ Rabiu Yusuf ezipụla ndị uweojii na gburugburu ebe ahụ, iji nwụchie ndị ahụ ma kpọpụta nwoke ahụ. Ha kwuru na ha na-aga n'ihu ịchọsi ndị a ike ma kwuo na onye ọ bụla nwere kepukepu gbasara ebe ha nọ, kọwara ndị uweojii." 42810093,https://www.bbc.com/igbo/42810093,E nwere ike iwa Olisa Metuh ahụ,Onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Sam Ben-Nwosu gwara BBC na ọ nọ n'ụlọ ọgwụ kemgbe ụbọchị anọ gara aga.,"Metuh nwere ikpe nọ n'ụlọ ikpe e tinyere n'ụbọchị nkwọ 29 Jenuwarị Ben-Nwosu sị na ihe na-arịa Metuh bụ ọrịa ọkpụkpụ azụ nke pụtara. Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-abuga Metụ ụlọ ọgwụ ọzọ (nke ga-eme ya atọ) n'Enugwu iji nwe odido anya ịmata ma a ga-awa ya ahụ. Cheta na a gba ọsọ buga Metuh nnukwu ụlọ ọgwụ, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospitalụ dị na Nnewi Anambra Steeti ka ọ dara ahụ." afirika-49635516,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49635516,"Onyeka Onwenu, Genevieve Nnaji, Linda Ikeji na ụmụada Imo state ndị ọzọ obodo Nigeria jiri biri",Ọ bụghị asị na ọtụtụ ụmụnwaanyị Imo steeti emetela ihe a ga-eji were ha na-etu ọnụ na Naịjirịa nakwa n'ụwa gbaa gburugburu.,"Ụmụnwaanyị ndị a egosila ihe mere ha ""dike"" n'ọgbọ e ji mara ha. Ọ bụ n'egwuregwu, ndọrọndọrọ ọchịchị, ime ejije, ka ọ bụ n'agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ? Ha bụ anụ a na-agba egbe ọ na-ata ahịhịa. Lee ụmụnwanyị ndị BBC Igbo chọpụtara bụ ọkaibe n'Imo State: Onyeka Onwenu Onyeka Onwenu bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ n'okpuru Ikedi Ohakim Onwenu bụ ""olu ogene"" nakwa agbara nwaanyị ma a bịa n'ihe gbasara ịgụ egwu. Dimkpa nwaanyị a bụ otiegwu, ọ rụburu dịka onye ntaakụkọ na BBC/NTA, ọ na-emekwa ejije na Nollywood kwa mgbe. O nwetala nturuugo dị icheiche maka ime ejije nakwa egwu ya. Kemafo Chikwe Ọ bụ nne otiegwu a ma ama bụ Naetochukwu Chikwe (Naeto C) Chikwe rụburu dịka mịnịsta na-ahụ maka njem site n'afọ 1999 ruo 2001, nakwa nke na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2001 ruo 2003. Ọ rụkwara dịka onye ntaakụkọ nakwa onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Aịalandị. Ọ bụ odeakwụkwọ nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba. A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 1951. Chris Anyanwu Anyanwu bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị aha ya na-ada ụda Anyanwụ bụ onye ntaakụkọ nwere ụlọ mgbasaozi nke ya. Ọ rụkwaala dịka sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa, ọ bụkwa odeakwụkwọ. Ihe o detara n'akwụkwọ mgbasaozi mere ka a tụọ ya nga mkpụrụ ọka site n'afọ 1995 ruo 1998, ma mee ka e nye ya nturuugo maka obiisiike ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba, 1951. Chinwe Norah Obaji Obaji bụ onye nkuzi e ji ama atụ Obaji arụọla dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa. Ụmụakwụkwọ na-achọ ibanye mahadum na Naịjirịa kwesịrị ịma ya makana ọ bụ ya tinyere iwu e ji malite ile ule ndị mahadum a kpọrọ ""Post UME"". Eucharia Anunobi Eucharia Anunobi bụzị onye na-agbasa ozi ọma nke Bekee kpọrọ ""Evangelist"" Anunobi bụ ome ejije a ma ama maka ime ejije ka ọ dịka ihe na-eme ezie. O meela ejije karịrị narị kemgbe o ji malite. A mụrụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, 1965. Genevieve Nnaji Genevieve Nnaji nwere nturuugo ""Member of the Order of the Federal Republic"" nke gọọmentị etiti nyere ya n'afọ 2011 A kọwa akụkọ maka ejije na Naịjirịa ma a kpọbeghị aha nwaanyị a Imo steeti ji eme ọnụ, aha e bidokwalanụ? Nnaji emeela ejije karịrị narị, ma nweta ihe nrite nakwa nturuugo karịrị iri. Ọ na-emepụtazị ejije nke ya ugbua, o mepụtara nke ndị ọnụ na-eru n'okwu na Hollywood zụụrụ. A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 1979. Rita Dominic Nwaturuocha Dominic na-ewukarị na soshal midia maka etu o si eke ekike na-aba n'anya Dominic bụkwa otu onye a na-asị ""ụnụ abịala"" n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood. O meela ọtụtụ ejije karịrị narị, ma rite nturuugo karịrị iri. A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Julaị, 1975. Linda Ikeji Ikeji bụ otu onye a na-akpụkarị n'ọnụ na Naịjiria ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ide ihe n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ ""Blogging"". Ọ nwere ụlọmgbasaozi nke ya, ọ bụkwa onye ọmepụrụ onye n'ihe gbasara ilekọta ụmụagbọghọ. O nwetala nturuugo ma na Naịjirịa ma na mba ofesi. A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba, 1980. Perpetua Nkwocha Nkwọcha bụzị onye nchịkọta otu egwuregwu ụmụnwaanyị dị na mba Swidin a kpọrọ Clemensnäs IF E nwereike ichefu nwaanyị a n'ụwa egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa n'ụwa a? Ihe Nkwocha ji ụkwụ gbaa n'ụwa a, ""2 ekenwughi ya"". O so Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mba Afrịka asaa, ma mabute iko ise n'ime ha. O nwetara nturuugo ""Nwaanyị kacha agba bọọlụ n'Afrịka"" ugboro anọ n'aka ndị Confederation of African Football (CAF). A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị 1976. Desire Oparanozie Oparanozie nwetara ihe nrite ""akpụkpọụkwụ ọlaedo"" maka ịbụ onye kacha nye goolu n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2014 Oparanozie bụ akwaa a kwụrụ n'ihe e ji ụkwụ eme n'ọgbọegwuregwu. Ọ gbaala bọolụ n'ọtụtụ otu egwuregwu na mba ofesi kemgbe ọ malitere iji ịgba bọọlụ akpa ego. O sorola Naịjirịa gaa asọmpi Iko Mbaụwa atọ, nakwa Iko Mba Afrịka anọ ebe o buliri iko anọ ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Disemba, 1993. Stephanie Okereke-Linus Okereke-Linus gbara onye nke abụọ oge o so zọọ ""nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa"" nke afọ 2002 Okereke-Linus sokwa na ndị nwere agba na Nollywood. Ọ na-eme ejije, na-ede ejije, na-emepụtakwa nke mbiputa. O nwetala ọtụtụ nturuugo site n'ime ejije, ọ bụkwa ""Member of the Order of the Federal Republic, MFR"". A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 1982. Chioma Ajunwa Ajunwa bụkwa onye ọgba ọsọ mgbe ahụ, bụzị onye uweojii Naịjiria ugbua Ihe Ajunwa mere n'egwuregwu Naịjirịa so n'ihe ndị mmadụ ga-akpụgide n'ọnụ n'ụwatụụwa. O ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo mbụ ya n'Olimpiks n'afọ 1996. O nwere nturuugo ""Member of the Order of Niger - MON"" A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba, 1970. Betty Anyanwu-Akeredolu Anyanwu-Akeredolu bụ nwunye gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu Ọ bụ onye na-akụ azụ na ụmụanụmanụ mmiri ndị ọzọ, ọ bụkwa omepụrụ onye. Makana ọ rịara ọrịa akpụ nke ara mana ọ taghị isi ya, o buzi ibuso ọrịa ahụ agha n'isi. A mụrụ ya n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, 1953. Munachi Abii Munachi Abii nwere ọ gụrụ egwu mbem a kpọrọ ""rap"" na Bekee Abii bụ ezigbote ""nwata makata mma"" nke gosiri oge o meriri n'asọmpi ""nwaanyị kacha maa mma"" n'afọ 2007. Ọ na-ede egwu, na-agụkwa agụ. Ọ bụkwa ihe Bekee kpọrọ ""model"". A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba, 1987. Chidinma Ekile Ekile bụ olu ogene na onwe ya A gụwa ụmụnwaanyị na-agụ egwu nwereike ime ka ị nyechaa ha ego i nwere n'ụlọakụ na Naịjirịa, Chidinma so n'ime ha. O nwetala ihe nrite ma gakwaa ọtụtụ mba dị iche iche site n'ịgụ egwu. A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee, 1991. Sandra Achums Achums so n'ụmụnwaanyị ""na-apụ ọkụ"" oge ọ na-eme ejije na Nollywood mgbe ndị dịka Dolly Unachukwu, Eucharia Anunobi na ndị ọzọ bụ ndị a na-achọ ka akara ọkụ. O mere ejije ruru 20 mgbe ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba, 1967. Lauritta Onye Lauritta Onye na-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpi ndị nwere ọrụsị O riterela onwe ya na Naịjirịa ọlaedo abụọ site n'ịtụ ""shotput"". Ọ bụkwa onye na-eme ejije na Nollywood. A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1984. Christy Opara-Thompson Christy Opara nwetara ọlanchara n'olimpiks nke afọ 1992 ma bụrụkwa nwaanyị kacha agba ọsọ n'ụwa nke afọ ahụ, Opara na-awụ awụ, na-agba ọsọ. Ọ gbatara otu ọledo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara n'ọsọ, ebe ọ wụtara otu ọlanchara oge ọ bụ ya. A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke Mee, 1970. Flora Nwapa Nwapa tinyere uchu n'ịrụgharị ala Igbo mgbe a lụchara agha Biafra E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Nwapa? Ọ dị egwu! Nwapa bụ 'a takata a gbọo' n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ. Ọ rụkwara dịka onye nkuzi, minista na-ahụ maka ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ, ma mechaa rụọ ka minista na-ahụ maka ala na mmepụta obodo. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931, mana ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993. Priscilla Nzimiro Nzimiro bụ nwaanyị Igbo mbụ bụ dọkịta ahụike, nke ọ gụtara na mahadum Glasgow dị na mba Skọtlandị N'agbanyeghị na ọ nwụrụ naanị ka otu afọ o ji gụchaa akwụkwọ o ji bụrụ dọkịta ahụike gachara, a ka na-echeta ya site n'ụlọakwụkwọ abụọ e hibere maka ya n'obodo ya bụ Ugwuta. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ji maka ya banye ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dọkịta ahụike. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Epreelụ 1923, ọ nwụọ ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, 1950. Ụmụnwanyị ndị ọzọ Imo steeti ji aba mba gụnyere Viola Onwuliri bụbu mịnịsta maka agụmakwụkwọ, Daniella Okeke na-eme ejije na Nollywood, Catherine Acholonu bụ odeakwụkwọ a na-anụ aha ya oge ọ dị ndụ, Lesley Obiora Amede bụ ọkaiwu na mba Amerịka, na ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Stella Oduah: N'obodo ga-adị mma bụ ụmụ agbọghọbịa" afirika-44272704,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44272704,Lee etu ndị mmadụ si cheta ụmụaka taa,"Onyeisiala BUhari ji akwụkwọ ozi o zigara ụmụaka taa wee bido ya bụ mmemme ebe ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gakwara sonyere ụmụaka taa, tụmadị ụmụaka ndị nọ n'ahụhụ dị icheiche. Ụfọdụ gara ebe ndị agha Boko Haram chụsasịrị bi ebe ụfọdụ gara ebe ndị ọzọ dị icheiche.","Ụmụaka bụ ọdịnaihu Naịjirịa mana ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta ezi nkuzi n'ụdị nkuzi dị na Naịjirịa ugbua Amalu Ngozi gosiri etu ya bụ mmemme si gaa n'ọgbọ egwuregwu dị n'Enugwu taa. End of Twitter post, 1 Nke a bụ foto ụlọọrụ onyeisiala zipuru igosi etu o si echeta ụmụaka, ha zipuru n'igwe twitter; N'akụkụ nke ya, onyeisi ndị ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki kwuru na ya gara ebe ogige ebe ndị oyiegwu chụsasịrị bi na Benue steeti, O kwuru na ụmụaka enweghi ihe ha mere ha jiri nọrọ ebe ahụ mana ha bụ ọdịnaihu ala Naịjirịa. N'aka nke ọzọ onye bụbu osote onyeisiala bụ Atiku Abubakar nọrọ n'akara twitter ya kwuo ka e cheta ụmụaka ma nọnyere ha, mee ka ha chịa ọchị. Onye meriri ihe nkiri BBN nke afọ 2018 bụ Miracle Ikechukwu ekpeghikwa azụ ebe o dekwara ozi nke ya ma ga nọnyere ụfọdụ ụmụaka ma kwuo na olileanya anyị ga-abalị na mmezu ma e soo ha nke ọma. Oluyemi Fasipe dere ozi nke ya ma kwuo na ya na-echetara ụmụ Naịjirịa niile na ndị mba ofesi maka Leah Sharibu bụ onye ndị Boko Haram kpọrọ ma na ha akpọghachitebeghi ya. O kwuru na ụmụaka ndị ọzọ na nne na nna ha nọ mana nwantakịrị nwaanyị a na ndị mụrụ ya anọghị, ka a ghara ichefu ya. Deekachy dere akụkọ na-agbawa obi gbasara nwantakịrị nwaanyị dị afọ 9 dị ime nke o kwuru na ya hụrụ ebe ọ chọrọ ịmụ nwa. Ọ kọwara na ọ lụrụ di n'afọ asatọ wee na-ekele ụmụaka niile ndị dị etu ahụ. Osinachi ji ọchị na-eme nke ya ebe ọ na-ekele onye ọbụla rugoro afọ 20 mana na-anata ndị mụrụ ya ego dịka nwantakịrị. Lee ihe ụmụaka chọrọ ka e mere ha taa bụ ụbọchị ha. Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ụgbụa Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44660025,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44660025,World Cup 2018: Gịnị mebiri egwuregwu ndị Afrịka na Rọshịa?,"Ọpụpụ Senegal n'asọmpi Iko Mbaụwa pụtara na nke a bụ ọpụpụ Afrịka kachasị njọ n'ime afọ 36, nke bụ na-enweghị onye si na mpaghara a ruru n'agba mgbapụ kamgbe 1982.","Ndị na-akwado Naịjirịa, Moroko na Senegal na-egosi mwute ha ka agbapụrụ ndị otu ha n'asọmpi a Ka ha na-abanye asọmpi a, olileanya ndị mmadụ bụ na Afrịka nwere ike ime ihe ha mere n'asọmpi nke Brazil 2014, ebe ọ bụ mbụ otu abụọ - ya bụ Naịjirịa na Ọlgeria - ga-eru agba mgbapụ. Kama, mpaghara ụwa a ga na-ajụ onwe ha ebe ihe si mebie ka egwuregwu 15 ha gbara pụtara na mmeri 10, ebe a gbara onye laba onye laba abụọ ma nweta naanị mmeri atọ. Kedụ ihe a ga-ebo ebubo: ihu ọjọọ, VAR, ka ọ bụ amaghị agba? Eze ndị Ijipt merụrụ ahụ Ihe a kwesịrị ịbụ asọmpi nke mba Ijipt ga-agbanwe ọnọdụ ha n'asọmpi Iko Mbaụwa, n'otu aka makana a na-ele otu ha anya na ha esighị ike; n'aka ọzọ na ha nwere otu n'ime ndị kacha agba bọọlụ n'ụwa ugbua. Mana etu ọbụla ị si chọọ ile ya anya, Mohamed Salah kparala ndị Ijipt ike - o nyere goolu asaa, nye aka inye abụọ, n'ime goolu 10 ha gbara site n'oge ha chọrọ ituru ugo ịbata Iko Mbaụwa ruo oge a gbapụrụ ha na Rọshịa. Mo Salah akpachaghị ike n'asọmpi a etu e chere na ọ ga-eme Ọ raghị ndị na-akwado ya ahụ ịmata uru ọ bara, ka ahụ o merụrụ na ngwụcha Champions League mere na o soghị gbaa egwuregwu mbụ ha na Yuregua gbara. Ka ọ na-anọghị ya, Marwan Mohsen bụ onye nyerela naanị otu goolu n'ime egwuregwu 23 ọ gbarala ndị Ijipt, akpanwughị ụdịrị ike ọ na-akpa. Asigodu na ahụ gbasiri Salah ike tupu asọmpi a ebido, o doghị anya etu ndị Ijipt kpọrọ onwe ha ndị Pharoah gaara esi mee n'ihe bụ asọmpi mbụ ha n'ime afọ 28. Nke a abụghị ihe atụwara anya n'aka otu Hector Cuper na-achịkọta, maka na kwa mgbe kwa mgbe ha mehiere - site n'itikọta Ali Gabr na Ahmed Hegazi ọnụ. N'agbanyeghị nke ahụ, ndị oche goolu ha bụ Mohamed El Shenawy mere ọfụma ọkachasị ka ha na Yuregua zutere, ebe oche goolu Afrịka ji eme ọnụ bụ Essam El Hadary dị afọ 45, mere ihe a ga-eji cheta ya site n'ịbụ onye kachasị nka n'asọmpi a, ma chekwaa penariti pụrụ iche. Nke ahụ bụ mbụ ha na-anọ n'ihu n'asọmpi Iko Mbaụwa, mana ka afọ 84 gachara, ha ka na-achọ inweta otu mmeri. Ndị Atlas Lions agbọghị ụja Njem Moroko na Iko Mbaụwa yasara mgbe ha riri ọkpụ nke aka ha ka asọmpị ha na Iran na-abịa na mgwụcha, nke nyere Iran mmeri 2-1. Onye nkụzị Moroko kpọrọ asọmpị a ""World Cup Final"", nke putara na ọ bụ asompị nke ha kpọrọ mkpa. Ihu ya ka agbachara asọmpị a gosiri na ya bu ihe were ya iwe. Ndị nkwado Moroko nwere aṅụlị etu ndi egwuregwu ha si gbaa bọọlu n'asọmpị a Mana, site mgbe ahụ gawa, Moroko gbara ọfụma. Ihe kpọghachịrị Moroko azụ bu na ha enweghi ndị ma etu esi enye goolu. Naịjirịa - otu egwuregwu nke echi Mmeri ndị Ajentina meriri Naịjirịa butere oke nkatọ na Naịjirịa dị ọtụtụ na-ajụ ihe mere echekwaghị ọnụ neetị nke ọma na n'oge ngwụcha asọmpi ahụ, mana oge ndị Super Eagles na Rọshịa jupụtara n'ihe ọma. Agbanyeghị na etinyere ha ""n'otu nke ọmwụ"", otu a kachasị jupụta na ndị ntoroọbịa n'asọmpi a nwere ndị ọgba bọọlụ mmadụ 18 na-agbabeghi asọmpi Iko Mbaụwa mbụ ka ọfọdụrụ naanị nkeji anọ ka ha gafee agba nke abụọ. Goolu Victor Moses nyere site na Penariti nyere Naịjirịa olileanya megide ndị Ajentina Ihe a bụghị otu Naịjirịa ndị nwere ngozi ọkpụkụ aka dịka ndị nke 1990 mana ha jupụtara n'ịdị 'otu na nkwekọrịta nke na-adịkarịghị n'otu ndị Super Eagles. ""E che m na ọdịnaihu dịrị ndị Naịjirịa maka na enwere oke ị dị n'otu - ị hụrụ n'oge tara akpụ, udị mmụọ otu a nwere,"" onye nchịkọta Gernot Rohr gwara BBC Sports. Nwafọ Jamịnị kwara arịrị etu ndị otu si amalite asọmpi ha niile na Rọshia, dịka Naịjirịa si daa n'ịkwanye ndị ọ bụ ha na ha ọkụ n'ike n'oge mbụ. Nke a gara nke ọma karịa ndị ọzọ nke bụ na-anụghị akụkọ ọbụla banyere esemokwu ndị isi nakwa akwụghị ha ụgwọ n'oge dịka o kwesiri Ogbenye ndị Tunisịa Tunisịa adịghị ike nkeọma ị gafe agba nke bụ siri ike gụnyere ndị Beljọm na Ịngland nke a bụ okwu si n'ọnụ onye nchekọta ha. ""Anyị nọ n'ebe dị anya n'ogogo a chọrọ,"" Nabil Maaloul kwuru, onye ndu bụ Wahbi Khazri kwukwara na ndị otu ya hụtara ndị nọ n'otu dịka ndị ka ha ukwuu nkeọma n'ogogo. Tunisịa meriri ndị Panama n'asọmpi ha nke mbụ n'Iko Mbaụwa n'agba nke mbụ Ndị Carthage Eagles daara mgbapụ asọmpi ha mgbe Ịngland meriri ha na ngwụcha oge mana ha hiwere obere aha dị oke ọnụ. N'arụghị ụka, otu a nwere ndị dị elu n'akara aka ahụtaghị enyemaka onye ọkacha agba ha bụ Youssef Msakni bụ onye mụrụ ahụ- mana ahụtaghị ọrụ ya n'otu dịka mba Beljọm gbara ha ọkpụ ise asatara abụọ. Agbanyeghi nke a Tunisịa hapụrụ asọmpi a dịka ndị kachasị nweta goolu n'Afrịka niile - nakwa o juju afọ. Ndị kwụọtọ dara n'ikpeazụ nke Afrịka Senegal bụ olileanya ndị ndị Afrịka mgbe ha merichara ndị Poland n'asọmpi nke mbụ ha nakwa nke Afrịka niile. 2-2 ha na ndị Jaapan gbara bụ nke ha bụ ụzọnye goolu abụọ mepere ụzọ ndapụ n'asọmpi ha na ndị Kolombịa - nke mechara bụrụ eziokwu. Senegal mechara daapụ n'Iko Mbaụwa mgbe ha nwetere akwụkwọ ị dọ aka n'antị karịa ndị Jaapan. Ọtụtụ mmadụ chere na Senegal bụ otu kachasị mma n'Afrịka mana obi gbawara ha oge agbapụrụ ha. Ọtụtụ ndị Senegal etiela mkpu n'iwu ọhụrụ ndị Fifa mere ha ji pụọ n'asọmpi a maka nnupuisi ha, onye nchịkọta ha bụ Aliou Cisse ekwenyeghi na nke a ma kwuo na ""ndị otu etozoghi"" ị gafe n'agba ọzọ. Dịka ọ dị n'ebe Egypt na Salah nọ, ọtụtụ ndị tụkwasịrị obi n'ebe Sadio Mane nọ mana ọ rara ya ahụ ime nke ọma n'asọmpi ahụ. Senegal bụ otu ọzọ n'Afrịka na-enweghi ndị ọgba n'etiti mana ha gbaliri n'ụzọ ndị ọzọ, ebe Kalidou Koulibaly na Salif Sane gbakọtara ọnụ n'ebe etiti. VAR o meriri mba Afrịka? Edela ma kwuo ọtụtụ ihe gbasara atụmatụ ọhụrụ nke video assistant referee (VAR) ndị Fifa wepụtara n'asọmpi a mana ọ bụghi ihe ịtụ n'anya na-echichi onye ọbụla dị iche iche banyere nke a. Eji video assistant referee (VAR) eme mkpebi banyere ọnọdụ na-edoghi anya. Ndị Naịjirịa ekwuola na mkpebi VAR megidere ha, kwuo na Marcos Rojo nke Ajentina kwesiri iri iwu mgbe oji isi mabanye bọọlụ n'aka ya na St Petersburg - Karịsịa mgbe enyerela Iran penariti maka ọnọdụ yiri nke a. Agbanyeghi mkpebi a dịka ọ dị njọọ, ogbu bọọlụ hụrụ maka asọmpi Naịjirịa-Ajentina mere mkpebi Na nke Egypt's - na Afrịka - ihuọma bụ mkpebi inye Salah penariti,bụ nke oji nye ndị Rọshịa goolu. Ndị Afrịka atụkwasịla ndị ogbu bọọlụ ha mere nkeọma na Rọshịa ma ka nọkwa ebe a, nke bụ na otu n'ime ndị Afrịka ka nwereike ị ga n'ihu n'asọmpi Iko Mbaụwa." afirika-52001037,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52001037,Coronavirus: Ozi ọma maka coronavirus,Ọbụghị naanị akụkọ ọjọọ ka e kwesịrị ịgbasa banyere ọrịa coronavirus. E nwekara akụkọ ọma.,"Kamgbe ọrịa coronavirus malitere kpawa ike, a nụla ọtụtụ akụkọ ọjọọ gbasara ya n'akụkụ ụwa niile. Akụkọ etu coronavirus si egbu puku kwuru puku mmadụ abụghịzi ihe ọhụrụ. N'ụbọchị Mọnde, ọrịa a gbukwara otu onye na Naịjirịa. Ma lee akụkọ ndị na-enye obi aṅụrị gbasara ọrịa a. Akụkọ ndị a gosiri na olileanya dị." 42879963,https://www.bbc.com/igbo/42879963,Ngige: Anyị ekweghị na-eji otu nde naira kwaa Ekwueme,Minista na-ahụ maka ọrụ na ikike ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na onweghị mgbe gọọmentị etiti kwere iji otu nde naira were mee akwamozu Ekwueme.,Ngige so na Kọmiti na-akwado akwamozu Ekwueme. Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ego ahụ bụ nke eji akwado ịhe niile ga-eso na akwamozu Ekwueme dịka ịdozi okporo uzo. Ọ sị na ihe ndị a dị na otu onyonyo na-eme ngaghari maka ndị chọrọ ị nyochapụta nke bụ eziokwu. Cheta nụ na ebubatara ozu Ekwueme unyahụ n'ụlọ ụgbọ elụ na Abuja ma bụga ya Enugu steeti maka nkwanye ugwu ikpeazu. afirika-53851863,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53851863,Mamman Daura: Olee ebe nwanne Buhari nọ ugbua?,"Dịka akụkọ na-ewu na sọshal midia na-ekwu na e bupụrụ Mamman Daura, nwanne nna Onyeisiala Muhammadu Buhari, ala Bekee maka nleta ahụike, ndị nọ ya nso si na ọ bụghị eziokwu, kama na ọ bụ ezumike ka ọ gara n'ala Bekee.","BBC na mmadụ atọ ndị nọ Daura nso nwere mkparịtaụka, ha wee gbaa ama n'ezie na Mamman Daura, nwunye ya, otu nwa ya nwoke, na otu nwoke ọzọ ji ụgbọelu aka mkpa (private jet) fega Lọndọn n'ụtụtụ Wenezde."" Ndị ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha kwuru n'ije ahụ nwoke ahụ gbara afọ iri asaa na itoolu gara abụghị maka nleta ahụike. Ha sịrị na ""ahụ siri Mamman Daura ike, na o nweghị ọrịa na-arịa ya,""kama ha kwuru na ahụ siri ya ike nke ọ gararịị akwamaozu onye bụbu ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Wada Maida n'ụbọchị Wenezde. Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọnọdụ ahụike Daura esichaghị ike nke mere ka e buru ya gawa maka nleta n'ala Bekee. Ndị ezinaụlọ Daura kwuru na o teela ha ji chọọ ka ọ gaa ala bekee gaA zuo ike mana o kweghị dịka o kwuru na ya anaghị aga ebe ọbụla n'ihi mgbachi obodo (lockdown). Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45332514,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45332514,Theresa May: Naịjirịa ọ bụ ala ndị ogbenye na-ezi okwu?,Ọ bụghịzị akụkọ na Ezenwaanyị Britein bụ Theresa May kwuru na Obodo Naịjirịa bụ Obodo nwere ndị kachasị daa ogbenye na mba ụwa niile.,"Agbanyeghị na Naịjirịa bụ Obodo kachasị nwe akụ na ụba n'Afirika, ndị nchopụta na-ekwu na ndị na-ata ahụhụ n'ime ya karịrị. Kama na kamgbe okwuchara ya, ụmụ Naịjirịa na-edepụta obi ha n'elu Soshal midia. @ChNnadozie kwuru na okwu a bụ ihe ihere diri Obodo Naịjirịa. End of Twitter post, 1 @CAgwulonu kwuru na nani ebubo enweghị ike ime Naịjirịa Obodo kachasị daa ogbenye. @NewtonEdogiawe1 kwuru na ọbụghị taa ka Naịjirịa bụ Obodo kachasị daa ogbenye. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56045142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56045142,Kamaru Usman vs Gilbert Burns: 'Nigerian nightmare' ga-alụ ọgụ na UFC n'ụbọchị Sọnde,Kamaru Usman bụ onye Naịjirịa na-eme egwuregwu ọgụ a kpọrọ 'mixed martial arts'.,"A mụrụ ya n'Edo steeti mana ọ hapụrụ Naịjirịa oge ọ dị afọ asatọ Kamaru Usman gwara BBC na o rere akpụ oge ọ bụ nwatakịrị. Ugbua, ọ bụrụla ọkaibe n'egwuregwu UFC. Kamaru Usman na Gilbert Burns ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Sọnde iji mata mbe abụọ nke bụ oke. Lee ihe dike a eji 'Nigerian nightmare' gwara BBC maka onwe ya." afirika-49203875,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49203875,Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe,"Ọ bụ be Fada ọzọ bụ ọyị ya ka Fada Paul Offu na-aga tupu ozute ndị omekome durala ya mmụọ, dịka a gwara BBC Igbo.",Fada Benjamin Achi bụ ọnụ na-ekwuru Ụka Katọlịk n'Enugwu sị na ọ bụ ebe ha nọ nzukọ ndị Fada emere n'Emene dị n'Enugwu n'ụbọchị Tụsde bụ nke abụọ n'ọnwa Ọgọst ka ozi rutere na Fada nwụrụ. Ọ sị na ọ bụ n'ụzọ si Ihe gawa Agbụdụ ka mkpa mkpa a kpara. Akụkọ metụtara nke a: afirika-46633014,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46633014,"Ọ ga-ekwe gị mee, kwuo ihe bụ 'Flag' n'Igbo",Asụsụ Igbo amaka ma dịkwa ụtọ ịsụ mana ụfọdụ mmadụ na-ahụtazi ya ka ihe rịara ahụ maka na a naghị asụzi ya kwa mgbe.,Nke a kpatara na a tufuola ụfọdụ mkpụrụokwu n'Igbo. Ndị ka na-eto eto ma ndị okenye ụfọdụ echezola ụfọdụ okwu ndị a. Nke a mere BBC igbo jiri banye ahịa Agụleri n'Anambara steeti jụọ ndị mmadụ ihe a na-akpọ 'Flag' n'asụsụ Igbo. Azịza ha ga-akpa gị ọchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-46474882,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46474882,PDP Rally: Ihe mere anyị agaghị ọsọ achụmnta vootu PDP - Umahi,Onye ndu ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ Dave Umahi ekwuola na ọ bụ maka a na-eme ọsọ achụmnta vootu a na mpaghara na mpaghara mere na ahụghị ndị gọvanọ PDP si mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọsọ achumta vootu PDP mere na ugwu na ndịda anyanwụ Naijiria.,"Umahi kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na-akwado maka nke PDP ga-eme na mpaghara ọwụwanyanwụ bụ ebe ha ga-apụta n'ebube ha. Ugboro abụọ PDP mere mkpatụ achụnta vootu maka ọkwa onyeisiala n'aha Atiku Abubakar na Peter Obi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị welitere isi na pati ahụ, agaghị ya. Umahi kwuru nke a site n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Emmanuel Uzo bụ onye gwara BBC Igbo nke a. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ndu PDP mpaghara ọwụwanyanwụ na-akwado Atiku na Obi n'ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya. Ihe mere anyị agaghị ọsọ achụmnta vootu PDP Uzo kwuru na ọ bụ n'Enugwu ka a ga-eme ọsọ achụmnta vootu ndị PDP nke mpaghara ọwụwaanyanwụ kama na e hibeghi ụbọchị ọ ga-abụ. PDP agbara ọsọ nta vootu maka mpaghara ugwu Naịjirịa na Sokoto Steeti n'ụbọchị Monde nakwa mpaghara ndịda anyanwụ n'Ibadan dị n'Oyo Steeti n'ụbọchị Tọsde. N'ime ọsọ achụnta vootu abụọ ndị a, onweghi onye ndu PDP si na mpaghara ọwụwanyanwụ so n'ime ha n'agbanyeghi na Peter Obi bụ onye na-azọkwa osote onyeisiala. Nke a ebutele oke arụmaụka n'etiti ndị mmadụ banyere ịdị n'otu ndị PDP na nkwado ndị ndu si mpaghara ọwụwanya n'ebe Atiku na Obi nọ." afirika-46714375,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46714375,Shehu Shagari: Buhari agaala mgbaru na Sokoto,Akụkọ dị mkpa: Mgbaru Shagari,"Onyeisiala Muhammadu Buhari agaala mgbaru n'ezinaụlọ onye chịburu Naịjirịa bụ Shehu Shagari, na Sokoto. End of Twitter post, 1 Cheta na e liri ya ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa a, n'usoro ndị alakụba. Ọzọ, Gọọmenti Anambra na-ekwu na ha achọpụtala ihe butere ọkụ a, ebe ndị uweojii na-ekwu na ha mabeghị ihe kpatara ya. Gọọmentị Anambara gwara BBC na ha amalitela usoro ịhọpụta 'nke bụ nke' n'ime ihe ruru ozu iri ise gbara ọkụ n'otu ụlọozu dị n'Enugwu Ukwu. Gụọ ya n'uju ebe a: 'Ozu gbara ọkụ ruru 50' - Kọmishọna ahụike Anambara N'ofesi, Kamal Hossain bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọso onyeisiala Mba Bangladesh bụ Sheikh Hasina oche ya na ntuliaka ha na-eme na mba ha, akatọọla ntuliaka ahụ ma kwuo sị ka e megharịa ya. N'agbanyeghị na ọ dị ka Hasina na-emeri site na vootu ole a gụkọrọla, akụkọ na-ekwu na aka enwe dị n'ofe, ebe ọgụ dapụtara na ntuliaka ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa. N'egwuregwu, Otu ọkpụ goolu Ngolo Kante nyerela Chelsea, mere ka ha merie Crystal Palace, ma mee ka ha were pọịntị ise na-aga Arsenal na Premier League. Ebe Man City gbarala isi onwe ha site n'iji ọkpụ goolu atọ merie Southampton na be ha. Ndị Igbo kwesịrịịchị n'afọ 2023 - Obasanjo Onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa akpọrọ Olusegun Obasanjo arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha nye ndị Igbo ohere ịchi Naịjirịa. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'Ukpor dị n'Anambara steeti. O gwakwara ndị Igbo ha kpachara anya ha maka nkwa APC na-ekwe ha maka inweta oche onyeisiala na n'afọ 2023 makana ọ bụ ihe efu i were okwu ndị otu pati ahụ wee mere ihe. Lee ihe ndị mmadụ sara ya na Twitter‏ @lanrehussain kwuru ka Obasanjo chere ka emecha ntuliaka 2019 tupu okwuwe maka ntuliaka nke 2023. @justopomulero na-ajụ maọbụ Atiku ka a ga-atụkwasị obi inye ndị Igbo ọchịchị n'afọ 2023. Mana ‏@AbdulRa60024938 etu o si nye onye Igbo ọchịchị n'afọ 2007. N'akụkọ ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ọkọlọtọ Naịjirịa yọdatatụ na ebe niile ehibere ụlọọrụ ndị agha Naịjirịa iji wee kwanyere Shehu Shagara onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa, nwụrụlanụ ugwu ikpeazụ. Eliri Shagari onye nwụrụ ụbọchị Disemba iri abụọ na asatọ n'Abuja na be ya n'ụbọchị Disemba iri abụọ na itoolu. N'ofesi Ebidola itu vootu na mba DR Congo kamgbe adọtịchara ntuliaka ruo afọ abụọ. Ihe ruru mmadụ nde iri anọ ruru itu vootu na mba ahụ ebe onyeisiala bụ Joseph Kabila nọ n'oche ọchịchị kamgbe afọ 2001 kwetere iritu. Mana nkwado ya bụ ntuliaka nwere ọtụtụ nwakpo na nsogbu makana achọrọ ịnapụ mmadụ ruru otu nde na ọma ikike ịtụ vootu. N'Egwuregwu, Kamgbe Liverpool merichara Arsenal n'asọmpị Premier League ha gbara n'ụbọchi Disemba iri abụọ na itoolu, ndị mmadụ kpụ ọgbabọọlụ Pierre -Emerick Aubameyang n'ọnụ. Ụfọdụ kwuru na etu o si gbaa boolu edoghị ụwa anya dịka onye ama na-akpa ike n'egwuregwu bọọlụ. Ha kwukwara na ohere ịsa goolu o mefuru karịrị akarị. Nkeji Ututu Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa 'Onye anọghị ebe e so kee ihe, oke ya efuo' - Victor Umeh" afirika-49994248,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49994248,Boko Haram: Ndị agha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016,Ndị Agha Naijirịa anwuchiela Alhaji Bukar Modu e ji Modu China bụ onyeisi ọkwọ ụgbọala ndị Boko Haram.,Bukar Modu bụ onye nke iri asatọ na itolu n'ime ndị oyi egwu nke ndị agha Naijirịa deputara a na-acho achọ. Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka e jidere Modu na ndị Boko Haram itolu ọzọ. Ndị Boko Haram ndị agha na-achọ Ndị agha Naijirịa depụtara nke a n'igwe twitter ha. Akụkọ ga-amasị gị Ihe Nkiri ga-amasị gị Ọka mmụta Boniface Igbenehue afirika-51450721,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450721,Car maintenance: Lee ihe ndị ị kwesịrị ime tupu ị nyapụ ụgbọala gị kwa ụbọchị,Ị bụ ọkwọụgbọala na-amaghị ọnọdụ ụfọdụ akụrụngwa dị mkpa n'ụgbọala gị?,"Akụkọ a ga-emepe gị anya. Ụfọdụ oge ka ndị mmadụ amaghị na ha kwesịrị inyocharịrị ọnọdụ ụfọdụ ihe n'ime ụgbọala tupu e buru ya pụọ, ka ọ ghara ibusa gị n'ụzọ. Ihe ndị dị ka mmiri 'radiator', mmanụ ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ. Tinye anya n'ihe nkiri a ka ị mụta otu ihe maọbụ abụọ maka ụgbọala gị. Ndị mere ihe nkiri a: Chimamaka Ihenacho, Chiagozie Nwonwu na Chiemela Peter" media-54818592,https://www.bbc.com/igbo/media-54818592,"""Anyị ahụbeghị ozu nwanne m kemgbe ndị uweojii gbara ya egbe n'afọ 2015""",Ngagharịiwe emere maka END SARS n'ihe ruru otu ọnwa gara aga kpalitere ọtụtụ ihe n'obi ndị mmadụ.,"N'obi Lonzo Nzekwe ọ bụ ozu nwanne ya nwoke ndị uweojii gbara egbe ma jichie bụ ihe na-eche ga. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, ọ kọwara etu ofufu nwa nne ya nwoke bụ Chukwudi Nzekwe si metụta ezinaụlọ ya. Gee ya n'uju ebe a: Ndị mere akụkọ a: Chiemela Peters Mgbeahuru na Chris Sanctus Okereke" afirika-48462602,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48462602,Rochas Okorocha: Akụkọ na anyị anwụrụla Okorocha bụ asị ọcha - EFCC,"Ikuku ekuola, ahụ ike ọkụkọ n'asịrị na-efeghari nke na-ekwu na Rochas Okorocha abanyela na mmiri ọkụ nke ngalaba na-alụ ọgụ megide nruruaka bụ EFCC siri.","Akụkọ fegharịrị n'ụlọntaakụkọ ụfọdụ nakwa soshal midia kwuru na EFCC wakporo ma nwụchie Rochas Okorocha na nwunye ya bụ Nkechi ma gbachie mahadum ya a kporo ""Eastern Palm University"". Mana EFCC gwara BBC Igbo na kepukepu ahụ na-efegharị nke kwuru na ha anwụchiela aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha na nwunye ya bụ ""okwu ụgha"". Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade nwere na ekwentị, ọ sị ""ọ bụghị eziokwu"". Otu na ndị nsonazụ Okorocha bụ FCC Jones kwukwara otu okwu ahụ. ""O nweghị ihe yiri ya mere."" ""O teghị aka m si n'ụlọ Okorocha ebe ya na ezianaụlọ ya na ndị ""Rochas Foundation"" nọkọrọ ọ were gwa ha na ya abụzighị gọvanọ Imo steeti."" Maazị Jones sị; ""Ọ (Okorocha) na-enweta onwe ya dịka ọ nọ na ezumike."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45544736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45544736,Idemmiri eriela obodo narị abụọ na Kogi steeti,Ihe ruru obodo narị abụọ nakwa okpuruọchịchị ruru iri anọghịzị n'elu ala ugbua dịka mmiri si n'idemmiri mikpuru ha n'ala na Kogi steeti.,"Nke a mere na ndị mmadụ agbahapụla ụlọobibi ha dị icheiche ma gbaa ọsọndụ n'ọgbọ enyemaka e kewapụtaara ha na steeti ahụ. Yahaya Bello gwara ndị ntaakụkọ na ụlọụka, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ugbo dị ịcheiche nọzị n'okpuru mmiri ugbua. N'ọnụ ya ""mmiri a karịrị nke anyị ji anya anyị hụ n'afọ 2012"" ma jirikwa ohere ahụ rịọ gọọmentị etiti enyemaka. Bello kelekwara ndị ọrụ gbatagbata dị icheiche maka etu ha sị enye aka n'ọdachi a mere. Ndị ọzọ ihe a metụtara agaala na be ụmụnwanne ndị bi n'elu ugwu ebe ha na-eche ka mmiri belata. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53144475,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53144475,Lee etu ndị ọcha siri gbanwee ụfọdụ omenala Igbo,Ọbịbịa ndị ọcha bịara n'ala ndị isi ojii nke ala Igbo so na ya bụ ihe hapụrụ ụkpụrụ siri ike na ngalaba ndụ ndị Igbo dị icheiche.,"Okwu a na-abụ okwu ndị kwe na ndị ekweghị maka ebe ụfọdụ na-eto ihe ndị ọcha mere, ndị ụfọdụ na-akatọkwa ha. Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo Kama dịka nke ahụ garala, ihe dị mkpa ịghọta bụ na ọbịbịa ha gbanwere ọtụtụ ihe n'ala Igbo ọkachasị n'ihe gbasara etu ndị Igbo si ebi ndụ. Ọtụtụ omenaala na ụzọ e si eme ihe gbanwere kpam kpam ebe a hazịgharịrị ụfọdụ ka o si dị ndị ọcha mma n'oge ahụ. Igbo mụtakwara nụ ọtụtụ ihe n'aka ndị ọcha, ụfọdụ dị mma mana ụfọdụ mere ndị Igbo etufuo nke ha. BBC igbo chọrọ ileba anya n'ụfọdụ omenaala Igbo ndị ọcha metụtara etu e si emezi ya. Omenaala Igbo ndị ọcha gbanwere 1. Okpukperechi Nke a bụ otu ihe doro ewu na ọkụkọ anya ma bụrụkwa ihe ọtụtụ ndị ji echeta ndị ọcha maka na ha gbanwere etu ndị Igbo si eme okpukperechi kpam kpam. Okpukperechi e ji mara ndị Igbo na mbụ bụ ifere arụsị na chi dị icheiche dịka Amadiọha, chukwu, ekwensu, ibini ụkpabi wdgz. Chi ndị a niile Igbo na-efe oge ahụ nwere ihe ndị a kpụrụ akpụ e ji ama chi ndị ahụ na ọnụ arụsị nke chi ọbụla ma nwekwaa ndị bụ ndị ọ dị n'aka ịhụ na a na-ekpere chi ndị ahụ dịka eze mmụọ maọbụ dibia. N'ime chi ndị a niile, Igbo kwenyekwara na onye ọbụla nwere chi nke ya bụ ihe na-edu ya mana chi kacha chi niile bụ Ezechukuokike Abiama bụ nke bụ nnukwu chi ebe ndị ọzọ bụ obere. Igbo na-achụ aja dị icheiche nye chi ndị a iji kelee ya maọbụ rịọ ya arịọrịọ ebe chi ndị a na-eke ikpe na emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị icheiche. Igbo Tradition: Uru egwu ọnwa bara n'ala Igbo n'oge gboo Mana mgbe ndị ọcha bịara, ha jiri okpukperechi nke ha bịa bụ nke ha kpọrọ ụka Krisiti. Okpukperechi nke a ka ha malitere ikesa n'ala Igbo ma gwa ndị Igbo na ha ekwesighi ife arụsị maọbụ ihe a kpụrụ akpụ. Ọtụtụ ezinaụlọ n'ala Igbo bụ ndị nabatara okpukperchi ndị ọcha kwatusiri arụsị ezinaụlọ ha ma kwụsị okpukpe omenaala mana o nwekwara ndị bụ ndị ọ na-eje ụka agọ mmụọ, ha nọ ebe a nọrọkwa ebe a. Nke a kpatara ọtụtụ ndị Igbo ji bụrụ ndị na-aka ụka taa mana ụfọdụ ka kwenyekwara n'okpukpe omenaala. 2. Alụmdi na nwunye Ihe gbanwere n'ihe alụmdi na nwunye dị ọtụtụ mana nke kachasị nke bụ na a malitere ịga n'ụlọụka mee agbamakwụkwọ karịa ịkụ aka, idebe ego na ịdọ mmanya a na-emebu na mbụ. Nke ka nke bụ na ụfọdụ ndị mmadụ malitere ịhụ agbamakwụkwọ e mere n'ụlọụka ka ọ ka mkpa karịa omenaala e kwesiri imere ezinaụlọ. N'oge mbụ, a na-eme ihe ndị a: a. Iru mgbede: A ga-edopu nwaanyị a chọrọ ịlụ ka o dochie ahụ tupu ọ laa n'ụlọ di ya mana mmekọ si n'aka ndị ọcha mere na a naghị emezi nke a n'ụwa taa. b. Ije di: Nwaanyị chọrọ ilu di na-agabu n'ezinaụlọ nwoke chọrọ ịlụ ya ka ya na nne dị ya nọrọ ka a marakwa ma a zụrụ ya azụ. Ụfọdụ mmadụ ka na-emekwa nke a mana ọtụtụ anaghị emezi ya. N'oge a, nwaanyị ahụ na-alụ di ga-eme ihe niile iji gosi nne di ya na a zụrụ ya azụ. c. Ịga ọrụ ọgọ: N'ụfọdụ omenaala, nwaanyị gaa ije di, nwoke ga-aga rụọrọ ndị ọgọ ya ọrụ dịka ịkọrọ ha ji maọbụ ihe ọbụla ha chọrọ. Ọ ga-enyere nna nwunye ya aka rụọ ọrụ a ga-eji ama ma ọ dịkwa ike ọrụ ọ ga-eji zụọ nwa ha nri nke ọma ka ọ bụ onye ume ngwụ. N'oge a, nwoke ahụ ga-agbalịsị ike ịhụ na o mepụtara ezinaụlọ ya ihu ka ihere ghara ime ya maọbụ a gwa ya na ọ gaghị alụzi nwaanyị ya. d. Ọgọ mara be: Ọtụtụ ka na-etinye uche na nke a, ọ ga-abụ nwoke na nwaanyị lụchaa onwe ha, ezinaụlọ nwaanyị aga n'ezinaụlọ nke nwoke ka e lee ha ọbịa, ka ha mara ebe nwa ha nwaanyị na-aga. A ka na-emekwa nke a n'ọtụtụ ebe mana oge a ọtụtụ ndị bizi n'obodo mepere emepe, ndị mmadụ anaghị etinyezi ya uchu mana oge a bụ oge ndị ọgọ ji ama ndị ọgọ ha ọ ga-abụ ha zute na mba, ha amara onwe ha. 3. Ejije Nke a gụnyere etu ndị Igbo si achọ mma, eyi akwa ma na-emekwa isi. Ọtụtụ ga-ajụ ma a na-eyidi akwa tupu ndị ọcha abịa? O nwere ike a naaghị akpọ ya akwa oge ahụ mana o nwere etu e si ekpuchi ọtọ ọkacha ụmụnwoke na ndị okenye. Ụmụaka na-agba ọtọ rue mgbe ha na-achọ ịwa akwa maọbụ ito ọgbọ ha ga-eji baa n'okenye. Ụmụnwaanyị anaghị ekpuchicha ahụ etu ahụ mana a na-eyi jigida n'ukwu, ụfọdụ obodo dịka Akwete na-akpakwa akwa mana ọ dịghị ọtụtụ. Ọ bụkwa ndị e chiri echichi bụ ndị na-eyikarị ya. Mana ndị ọcha wetara uwe ịcha icheiche na akpụkpọ ụkwụ. Echetere m na nne m kwuru na ha hụrụ ndị ọcha ka ndị dị mmụọ na-enweghi ụkwụ maka na a naghị ahụ ụkwụ ha anya. Ma uwe ishiagụ ndị Igbo na-eyi taa dịka uwe ha bụ mbubabta ka e bubatara ya site n'ofesi. Naanị Akwaete bụ akwa ndị Igbo ji aka ha akpa. Taa, uwe karịrị akarị a na-eyi dịka ịba, tawụza, akwa obi wdgz. Ụmụagbọghọ na-etechakwa tupu ndị ọcha abịa mana a na-eji ọtanjere na uli na ihe ndị ọzọ mana taa, ndị ọcha ewetala ude na akụrụngwa ndị ọzọ. Oge gboo, ma nwoke ma nwaanyị na-akpa isi mana taa, a na-ahụzi nwoke na-akpa isi ka o mere arụ. 4. Nri Etu Igbo si esi nri gbanwere ọtụtụ mgbe ndị ọcha bịara. Igbo nwere mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ ha ji esi nri ha dịka ogiri na anụ ọhịa. Nke a agbanwechaghị kpam kpama kama ndị Igbo nabatara nke ndị ọcha tinyekwara nke ya. Taa a na-eshi nri dịka osikapa, akpụ, ogede, jioko wdgz. Nri ndị a abụghị ihe ndị Igbo na-emepụtabu mbụ. Mana ha gbakwunyere ya na nke ha. Etu e si esi nri gbanwekwara. Ndị Igbo na-ejibu ite a kpụrụ akpụ a na-akpọ ọkụ esi nri mana ndị ọcha wetara ite igwe na efere na ngaji. 5. Ọgwụ O nweghi ihe dịka ụlọọgwụ n'oge gboo n'ala Igbo, gbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ ka e ji agwọ ọrịa. Mana ndị wetara ụdị ọgwụ nke ha ma rụkwa ụlọọgwụ n'ụfọdụ ebe. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị Igbo ekwesighi itufu mgbọrọgwụ ha kama ha kwesiri ileba anya were akụrụngwa ndị ọcha hazigharịa ya. 6. Agụm akwụkwọ Nke bụ eziokwu bụ na Igbo enweghi ihe a kpọrọ agụmakwụkwọ ruo mgbe ndị ọcha bịara. Nna nwere ụzọ o si akụziri nwa ya ihe ọ chọrọ ka ọ mara mana ọ bụghị ịba n'otu ụlọ nọrọ ala lewe anya na bọọdụ. Nke bụ eziokwu bụ na ndị Igbo hụtara ndị na-aga akwụkwọ oge ahụ dịka ndị ume ngwụ mana nke ahụ gbanwere dịka ụbọchị na-aga echiche ahụ gbanwere maka agụm akwụkwọ wetara ọtụtụ mgbanwe dị mma n'obodo. 7. Asụsụ Ndị ọcha bụ ndị mere na ọtụtụ ndị mmadụ anaghịzi asụ asụsụ Igbo nke ọma maka na ebe a na-achọ ịmụta asụsụ Bekee, e were Igbo ka nke na-abaghị uru. Nke a bụ ihe na-adabachagị maka na asụsụ dị ezigbo mkpa. Ugbua, ọtụtụ ndị Igbo etinyewala uche na ịmata asụsụ Igbo maka na o nweghi asụsụ ka ibe ya mkpa. 8. Igbu ejima Nke a bụ otu ihe e ji aja ndị ọcha mma n'ụwa niile ọkachasị nwaanyị Mary Slessor bụ onye kwụsịrị ụdị omenaala ahụ na Kalaba. Taa, ụmụ ejima na-adịzị ndụ, o nweghi onye na-ahụta ha dịka abụmọnụ n'ụdị ọbụla. 9. Njem Nke bụ eziokwu bụ na ndị nna ochie bụ e ji ụkwụ eje Aba. A na-eme njem otu ọnwa jiri ụkwụ maka na ụgbọala adịghị. A gagide, ebe chi jiri, a kwaa ute hie ụra, chọọ anụ ọhịa gbuo mụnye ọkụ taa ya. Mana ndị ọcha wetara ụgbọ igwe dị icheiche rue ugbua, nke a ka na-agbanwe, e nweziri ma nke na-efe 'elu na-aga n'elu mmiri nke ga-abụ ezi ihe ịtụ n'anya nye ndị gboo. Ihe mere m ji jiri ọja et0 chineke - Fada Chidika Okolie Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44583482,https://www.bbc.com/igbo/44583482,Kedụ nwa afọ Igbo ahụ Buhari mere otu n'ime ndị isi CBN?,"Onyeisiala Muhammadu Buhari emela ọkammụta Justitia Nnabuko na mmadụ atọ ndị ọzọ gụnyere; Mike Obadan, Adeola Adetunji, nakwa ọkammụta Ummu Ahmed Jalingo dịka ndị isi ụlọakụ etiti, Sentralụ Bankị nke a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ.","Muhammadu Buhari ga-azọ agba nke abụọ dịka onyeisiala Naijiria Ọkwa ọrụ a nke bidorola n'abali asaa nke ọnwa Juun ka anọ afọ anọ. Nnabụkọ bụbụ ọkammụta 'Marketing na University of Nigeria Nsukka ebe ọ kụzịrị nkuzi ihe karịrị afọ iri atọ. Ọ rụkwara ụlọakụ First Bank ọrụ. Onye odeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ Olusegun Adekunle, bụ onye kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi ezitere ndị ntaakụkọ. Buhari gbatịkwara oge Ogbonnia Ibe-Enwo, dịka onyeisi ụlọakwụkwọ dị elu, Federal Polytechnic, Unwana Afikpo, dị n'Ebonyi steeti,bụ Dr. Ogbonnia Ibe-Enwo, agba nke abụọ ga-anọ afọ anọ bido n'abali asaa nke ọnwa Ọgọstụ. Ndị ọzọ onyeisiala nyere ọkwa ọhụrụ gụnyere ọkammụta Abdullahi Yusuf, onye o mere onyeisi ụlọọgwụ University of Ilorin Teaching Hospital bido n'abali iri na itoolu Juun maka anọ. Buhari gbatịkwara oge onyeisi ụlọakwụkwọ, the Federal Polytechnic, IIaro, Ogun State, Olusegun Aluko, maka agba nke abụọ ga-ebido na 'abalị 25 nke ọnwa Septemba. Ọ gbatịkwara oge ọkammụta Sunday Onohaebi dịka onyeisi National Institute of Construction Technology, Uromi, dị n'Edo steeti agba nke abụọ bido n'abalị 25 nke ọnwa July. Akwụkwọ ọzị ahụ kwuru na ọ tụtụ anya na ndịa e nyere ọkwa ọhụrụ ga-ahụ ya dịka oku ife ala nna anyị ma kwụwa aka ọtọ n'ọrụ ha iji mejupụta olileanya ndị mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45967477,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967477,Hyperrealism: 'A na m ese ihe maka ndụ ndị nnanna anyị',Hillary Emetuche bụ nwata akwụkwọ Mahadum ejirila ọnatarachi ya mere ihe baara ya uru.,O kwuru na ọ dịghị mfe inweta ngwa ọrụ ya n'ala Naịjirịa mana ọ kwụsighị ya ịse ihe ọ na-ese. Emetuche kwuru na o na-ewe ya ihe ruru ọnwa abụọ iji sechaa otu ihe eserese ya. Gee n'uju ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị egwuregwu-49511085,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49511085,Chelsea vs Sheff Utd: Zouma abụrụla eju gbọnyụrụ ọkụ Chelsea mụnyere,"Agbanyeghị na Chelsea ji ọkpụ goolu abụọ mechie agba nke mbụ n'asọmpi a, Sheffield United dọkatara abụọ ji nara ha ọchị n'ọnụ na ngwụcha agba nke abụọ.","Ọ bụ Tammy Abraham nyere goolu abụọ nke Chelsea nwetere na ya bụ egwuregwu. Callum Robinson dọtarala Sheffield otu goolu ka o ji elekere 45 banye n'ime agba nke abụọ. Onye egwu Chelsea bụ Kurt Zouma na-atagbu onwe ya n'ụta makana ọ bụ ya nyere otu na goolu nke mere ya abụọ abụọ. Zouma nyere goolu mere ka Sheffield sata abụọ Chelsea nyere ha Ihu onye ndu Sheffield bụ Chris Wilder bụ sọ ọchị mgbe egwuregwu a biri, ebe Frank Lampard nọ na-ajụ onwe ya ebe gwongworo a kụrụ ya si mapụta. Ndị ọzọ ọchị adịghị n'ihu bụ ndị na-akwado Chelsea. Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia: O nwere ndị sị na ọ bụ onyeisi ha bụ Cesar Azpilicueta bụ isiokwu. Nwekwaa ndị na-ebo ndị na-eche azụ, nke Azpilicueta bụ otu n'ime ha, ebubo na ọ bụ ha kpara goolu gara Chelsea." 44915051,https://www.bbc.com/igbo/44915051,AFCON: Flying Eagles enweela nnukwu mmeri,Flying Eagles ga-asọmpị na AFCON,"N'egwuregwu, otu Flying Eagles emeriela Mauritania ọkpụ ise na-asataghi ihe n'ime asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-agba n'asọmpị iko mpaghara Afirika n'afọ 2019. Nkea pụtara na ha ga-eso n'ime ala dị iche iche ga-asọmpị AFCON n'afọ na-abịa. Ọ bụ n'ala Niger ka asọmpị a ga-ebido n'ime ọnwa Febuwarị. Miyetti Allah kwesiri ịza ajụjụ - Gowon Onyechiburu Naịjirịa dịka onyeisiala n'oge garaaga bụ Yakubu Gowon ekwuola na obi gbariri ya agbari maka ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'aka ndị na-achị ehi buru egbe na steeti di iche iche n'afọ a. N'ime ogbakọ Gowon na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom mere, o kwuru na oge eruola ndị ọrụ nche dị iche iche n'ala Naịjirịa gbara onyeisi ndị otu Miyetti Allah ajụjụ ọnụ ga-akọwa ihe mere udi ihea na-eme n'ala a. O'diakpo Obire apụọla na APC Akụkọ pụtara na Delta steeti ugbua na-ekwu na O'diakpo Obire bụbụ onye na-azọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Delta steeti n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ahapuọla patị APC gawa otu Progressive Peoples Alliance. Obire kọwara na ọ hapụrụ APC Delta steeti maka ọtụtụ nsọgbu na-emebi ihe n'ime patị a na steeti ahụ. Okpomọkụ na-egbu nmadụ na Japan Gọọmentị ala Japan na-adọ ndị ala ha aka na ntị ka ha zọ ishi ha maka nnukwu okpomọkụ na-egbu mmadụ ugbua n'ala ahụ. Akukọ pụtara n'ala ahụ ugbua na-ekwu na mmadụ ruru iri atọ anwụọla maka okpomọkụ a. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu" afirika-43939676,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43939676,A gbala ogbunigwe n'ụlọ Nwodo,"Ndị amaghị ndị ha bụ agbala ogbunigwe n'ụlọ onyeisi otu Ohanaeze Ndigbo bụ Nnịa Nwodo n' Ukehe, Enugwu steeti.","Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Akụkọ kwuru ndị amabeghị ndị ha bụ tubara ogbunigwe na ngwuru Nnia Nwodo nke gbara ma mebie akụkụ ụlọ ya. Ndị uweojii na Enugwu steeti kwuru na ọdachi a mere n'ezie, ma kwukwa na o mebiri obere ihe. Ha kwụkwa na ha ọ nọrọla ebe ahụ ihe meere. End of Twitter post, 1 Akụkọ ka na-abịa" afirika-55093347,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55093347,Nigeria's Lekki shooting: Ihe merela na nnyocha nke Lagos kemgbe ahụ,"Mgbọ egbe a kwara oge a na-eme ngagharịiwe megide mkpagbu ndị uweojii nke a kpọrọ 'End SARS' na Lekki Toll Gate dị na Legọs, butere nkatọ si ụwa gbaa gburugburu.","Mana e wepụ nke bụ eziokwu doro anya bụ na a kwara mgbọ, ndị na-eme ngagharịiwe na ndị ọrụ nchekwa na-arụrịta ụka maka nke bụ eziokwu gbasara ihe mere n'abalị ahụ. A nọ na-atụ anya na ndị a họpụtara ga-eleba anya n'ihe gbasara ihe mere na Lekki nakwa maka mmegbu ndị uweojii ga-eme ka ihe doo ndị mmadụ anya. Mana nke ahụ emebeghi. Ndị ọrụ BBC nọ na nnyocha nke Legọs, lee ihe merela kemgbe ahụ: Onye zigara ndị agha na Lekki Toll Gate? Ọbịbịa ndị agha na Lekki Toll Gate oge a na-eme ngagharịiwe n'udo butere ọtụtụ nkatọ, mana ruo ugbua o dobeghi anya onye zigara ha. Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti tinyere mmachi ngagharị n'ụbọchị Ọktoba 20 iji gbochilatatu ọgbaghara dapụtara na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ oge a na-eme ngagharịiwe na-akpọ oku ka e kposa otu ndị uweojii a kpọrọ 'Special Armed Robbery Squad' (Sars). Ụgbọala ga-agafenwuzi etu ọ masịrị ya na Lekki toll gate Ka awa ole e ji tinye mmachi ngagharị a gafere, ndị agha rutere na Lekki Toll Gate ahụ bụ ebe ndị na-eme ngagharịiwe nọ kemgbe ụbọchị ole. Iji saa ajụjụ a jụrụ ya gbasara etu ndị agha si rute ebe ahụ, Sanwo-Olu gwara ndị ntaakụkọ 'Arise TV' n'ụbọchị Ọktoba 22, na o nweghi ikike iziga ndị agha n'ebe ahụ a na-eme ngagharịiwe. Ndị agha na onwe ha, gwara ndị na-eme nnyocha n'ụbọchị Nọvemba 14 na ọ bụ Maazị Sanwo-Olu zigara ha na Toll Gate ahụ. Brig-Gen. Ahmed Taiwo kwuru na gọvanọ ahụ rịọrọ ka ndị agha gbatara ya ọsọ enyemaka n'ihi na okwu dapụtaranụ bịara karịa ndị uweojii. Na nnọkọ ndị nnyocha ọzọ e mere n'ụbọchị Nọvemba 21, Taiwo bụ onye nọchitere ndị agha na ya bụ nnọkọ kwuru na ozi e dunyere ha abụghị ikposa ya bụ ngagharịiwe mana ọ bụ ""ịhụ na ihe laghachịkwara etu ọ dị na mpaghara Eti-Osa (akụkụ ebe Lekki Toll Gate )"". Gọvanọ asabeghi ndị agha nke a ruo ugbua. Ndị agha a gbara egbe ezigbo mgbọ dị? A na-ebo ndị agha na ndị uweojii ebubo ịgba ndị na-eme ngagharịiwe na ndị nọkwa nso ebe ahụ egbe. Otu mbaụwa na-ahụ maka ikike dịrị onye Bekee kpọrọ'Amnesty International,' kwuru na mmadụ 12 nwụrụ. Na mbido nnyocha a, ndị agha gọrọ ụkwụ na aka ha na enweghi onye ha gburu, ma kwusie ike na ọ bụ egbe ezigbo mgbọ adighị ka ha gbara ndị na-eme ngagharịiwe. DJ Switch bụ onye ji ekwentị ya na-ese ihe nkiri gosiri etu ihe si aga mgbe ndị agha na-akwa mgbọ na Lekki toll gate esila Naịjiria gbafuo kemgbe N'ụbọchị Nọvemba 21, Brig-Gen Taiwo gwara ndị na-eme nnyocha na ndị agha ji ma ezigbo mgbọ ma nke adịghị agba agba n'ihi na ""ndị agboro"" fanyechara onwe ha na ya bụ ngagharịiwe ma na-achọ imebi ihe. Ka a na-ajụgharị ha ọnụ, Taiwo nọchitere ndị agha kwuru na ndị agboro nọ na-atụ ndị agha na-agagharị nso 'Oriental Hotel' dị nso Lekki Toll Gate ahụ okwute, nke merụrụ otu onye uweojii ahụ. ""A tụrụ ha okwute nso 'Oriental Hotel', ihe ha mere iji saa ha bụ ịgba egbe ezigbo mgbọ adịghị. E merụrụ otu onye agha ahụ; a tụrụ ya okwute na mgbịrịgbaọnụ. Ọ bụrụ na a tụrụ anyị okwute, naanị ihe anyị nwere iji saa ha bụ mgbọ egbe (nke abụghị ezigbo mgbọ)."" Kedụ ihe akụkọ BBC kwuru? N'ọgbakọ nnyocha niile nakwa n'akwụkwọ ozi, ndị agha gosiri akụkọ BBC wepụtara maka ihe mere na Lekki Toll Gate nke ha kwuru kwadoro ihe ha kwuru na ha gbaliri egbe elu na ọ bụghị n'etiti ndị ngagharịiwe. Onye ntaakụkọ BBC Pidgin bụ Damilola Banjo kwuru ihe ọ hụrụ n'oge ọ na-ese ihe onyonyo n'ebe a na-eme ngagharịiwe. Banjo bụ onye hapụrụ ebe ahụ n'ime nkeji 25 ndịagha bịara, kwuru: ""Tupu anyị e si ebe ahụ pụọ, ndịagha nọ na-agbali egbe elu ma mgbe anyị na-eze isi onwe anyị, ahụrụ m otu nwaokorọbịa na-azọ ume ndụ. ""Eche m na ihe butere nsogbu ya nwereike ịbụ obi nkoropu n'ihi egbe ndịagha na-agbali elu nakwa ụjọ juru n'ebe ahụ. ""A gbagidere egbe ruo ihe dịka nkeji 20, anyị magidere afọ n'ala ma si n'etiti igwe mmadụ pụọ maka ọghọm ịzọgbu mmadụ n'ụkwụ. Onyeisi m mechara gakwuru otu onye agha iji gosi ya na anyị bụ ndị ntaakụkọ tupu ha ekwe anyị gafee. Any mere nke n'ihe dịka nkeji 20 rute 25 a nọ na-agba egbe."" 'Ha wakporo ụlọ oriri m, buru njuoyi 7,ite 25, buo ihe nri niile ma hapụrụ m sọ ụkwa' Onye gbanyụrụ ihe onyonyo CCTV? Ihe ọzọ na-eko okwu n'egbe a gbara na Lekki Toll Gate bụ etu ihe onyonyo ji na-adịghị n'abalị ahụ ihe a mere. Mgbe Abayomi Omomuwasan onyeisi ụlọọrụ Lekki Concession Campany na-ahụ maka Lekii Toll Gate gwara kọmiti na-enyocha okwu a, ọ sị na ọ bụ ikuke netwọk mere ihe onyonyo ji kwụsị ọrụ n'Elekere Asatọ. Mgbe ọ na-aza ebubo kwuru na ha maara ụma gbanyụọ ọkụ n'ebe a na-eme ngagharịiwe, Omomuwasan, sị n'ihi mmachị onye apụla n'ezi gọọmentị steetị tinyere, ụlọọrụ LCC wezugara ndịọrụ ya nke mere na ha enweghi ike gbanye igwe ọkụ nta mgbe igwe ukwu na-enye ọkụ nyụrụ. Angela Okorie na-eme ejije sonyere ngagharịiwe END SARS n'Ebonyi steeti Mmadụ ole nwụrụ? N'ịza ebubo na ndịagha gbagburu ọtụtụ ndị mmadụ na Lekki Toll Gate nakwa gburugburu ya, Gọvanọ Sanwo-Olu gwara CNN na ozu mmadụ abụọ nọ n'ụlọ ozu ma kpọọ oku ka ndị nwere ihe akaebe n'ọnwụ mmadụ maọbụ ezinaụlọ sị na mmadụ nwụlahụrụ pụta. Mana ndị agha Naịjirịa agọọla na o nweghi onye ọbụla ha gburu na Lekki Toll Gate. Ọchịagha Taiwo gwara kọmiti nnyocha na otu onye nwụrụ site na mkpasasị uche n'ihi ihe ọ gabibara n'okporoụzọ Admiralty (3km; 2 miles na Lekki ) ebe ndị uweojii butere ozu onye ọzọ site na Yaba nke Legọs. Oge ole ka komitii nnyocha a ga-anọ? Onye ndu kọmiti a bụ Ọkaikpe Doris Okuwobi, ndị otu ya gụnyere ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike dịrị onye, ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka ikike dịrị onye, ụlọọrụ 'Citizens Mediation Centre' nakwa mmadụ abụọ na-anọchiteanya ndị ntoroọbịa. Otu n'ime ndị na-anọchite ndị ntorobịa na nnọkọ nnyocha a bụ Oluwarinu Odulala so n'ime ndị a kacha nụ olu ha oge a na-eme ya bụ ngagharịiwe Kọmitii nnyocha nke Legọs enwetela mkpesa karịrị 110, a na-atụ anya na ha na ndị ọkaiwu na ndị akaebe ha ga-eleba ha niile anya. Komitii a gụnyere mmadụ asatọ malitere n'ụbọchị 27 ọnwa Ọktoba. Ha ga-enwe ọgbakọ ọnwa isii iji nyochaa ebubo mkpagbu ndị mmadụ n'aka ndị uweojii iji maa ndị aka ha adịghị ọcha ikpe ma tụnye arọ ka e tie ndị o metụtara aka n'obi." afirika-46121519,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46121519,Nsogbu anyị na-ahụ n'ụzọ - Nwaanyị na-akpa ndị ọkwọ ụgbọala obi ụtọ,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Josephine Okeme bụ nwaanyị uweojii na-atụziri ụgbọala n'okporoụzọ.","Ọ kọwara etu ndi na-anya Danfo na ndị ọzọ ji enye ya nsogbu n'ọrụ. Okeme ji ọkwa ASP n'ọrụ uweojii, kwuru na ndị Keke na ndị ọgbatumtum so kwa na ndị na-enye ya nsogbu. Ọ gara n'ihu nye ndị ụgbọala ndụmọdụ ka ha na-erubeisi n'iwu nakwa ọkụ na-achị okporoụzọ. Okeme gwara ndị na-akwọ ụgbọala ka ha ghara ị na-anya warawara wara n'ụzọ. Ọzọ okwuru bụ na ndị mmadụ na-akwado ya ọfụma, nke a na enye ya ọṅụ, na ikike ịrụ ọrụ ya ọfụma. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-56870300,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56870300,"Ọ bụ m rụrụ akpụrakpụ Otigba, ya mere m ji agba mbọ ịrụgharị ya ka m ka di ndụ - Chris Chuba",Ọ bu n'oge Chris Chuba bụ nwata akwụkwọ na mahadum IMT dị n'Enugwu ka ọ rụrụ nka Otigba.,"Ọ bu n'afọ 1981 ka o mere nke a tupu ndị ọchịchị ndị agha buru ya gawa ebe e mechara mara ka ""Otigba Junction"". Ọ nọ ebe ahu ruo oge ndị na-eme ngagharịiwe Endsars jidere ya kụrịe. Na onyonyo a, Maazị Chuba kowara BBC ihe o chere maka ọrụaka ya pụtara dịka nka so n'ime ndị akachasị mara n'Enugwu kemgbe ihe karịrị afọ 35. O kwukwara ihe o chere maka etu gọọmentị esighi etinye aka na nrụgharị nka a." afirika-48502891,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48502891,State Police: 'Ka steeti niile nwe uweojii nke ha' - Ngalaba onyeisiala Buhari hibere maka SARS,Ngalaba onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari ehibere ka ha tinye anya n'ihe metụtara otu uweojii puruiche akpọrọ SARS ekwuola na ọ ga-adị mma maọbụrụ na steeti n'okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na Naịjirịa ga-enwee uweojii nke ha.,"Onyeisi ngalaba a akpọrọ ""Presidential Panel"" na Bekee bụ Maazi Tony Ojukwu bụ onye nyere Onyeisiala Buhari akwụkwọ nchọpụta ha sị: ""Anyi nwetere mkpesa otu narị iri na atọ na Naịjirịa maka mmegbu ndị mmadụ n'aka SARS, anyị nwetekwara atụmatụ iri abụọ na abụọ maka otu a ga-esi gbanwee ma dozie otu SARS na ndị uweojii niile."" Nye anyị ikpemkwụmọto n'okwu Kolade Johnson- Ndị ntorobia Cheta na ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa nọbụ na-eti mkpu ka gọọmenti tinye anya na SARS, bụ ndị a na-ebo mpụ na mmegide mmadụ. Ha ji akara #EndSARS na Twitter were na-akwado ka emegharịa SARS. Na nnabata mpkebi nagalaba o hibere, onyeisiala Buhari kelere ha maka ọrụ ha rụrụ ma gakwa n'ihu nye iwu ka onyeisi ndị uweojii na ndị ""National Human Rights Commision"" (NHRC) ga-ahazie etu a ga-eji mezuo atụmatụ ewetere. Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere Segun Awosanya bu onye eji atụmatụ #EndSARS mara, sị na nhazịgharị SARS na uweojii dị ezigbote mkpa: #EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata Onye ọzọ bụ Immanuel Ibe-Anyanwu na onwe ya gwara BBC Igbo etu ndị SARS jiri wakpo ya: Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya." afirika-51026846,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51026846,Archbishop Adewale Martins ekwuola na amụma Mbaka buru maka Hope Uzodinma na-eme ihere,Achịbishọp Adewale Martins nke Legọs Katọlịk Dayọsis ekwuola na ihe ụka Katọlik nwereike ime gbasara Fada Ejike Mbaka bụ ịmachi ya ime 'adoration ministry' ya.,"Achịbishọp Martins kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ebe ọ tinyere ọnụ n'ihe gbasara amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma iweghara oche ọchịchị Imo steeti. O kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n'anya na Mbaka ga-ekwunwu ụdịrị okwu ahụ banyere ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ma kwuo na ọ bụ ihe na-eme ihere. Ọ sị: ""I kwusị ya ime mịnịstrị ya bụ ihe e nwere ike ime ya."" O kwukwara na dịka ụlọụka, na ha kwesịrị ị na-ekwu okwu site n'ọnọdụ ụkpụrụ. Gee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju. Ndị mere ihe nkiri a bụ Nnamdi Agbanelo na Jessica Nwankwo." afirika-43051825,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43051825,Mberede okporoụzọ egbuola ụmụakwụkwọ 21 na ndị nkuzi,Ụmụakwụkwọ iri abụọ na otu na ndị nkuzi abụọ si njem mmụta anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ dị na Kano steeti.,"Otu nwata akwụkwọ na otu onyenkuzi bụ ndị na-anwụghị n'ihe mberede ahụ Ha si obodo Misau dị na mpaghara ugwu-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe ha gara njem mmụta ihe bekee kpọrọ 'excursion'. Ha bụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Junịọ Sekọndrị, Misau. Ndị otu Federal Road Safety Commission (FRSC) nke Kano steeti, na ndị isi ụlọakwụkwọ ha gwara BBC na ụgbọala bu ụmụakwụkwọ a na ụgbọala ukwu kụkọtara isi ọnụ. Mmadụ niile ahụ nwụrụ n'ebe ahụ ozugbo. Nanị otu nwata akwụkwọ na otu onye nkuzi nwụfọrọ." afirika-56992650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56992650,Father Mbaka: Bishop Onaga enyela ndị ụka Katọlik n'Enugu ọpịpịa abalị asaa maka ime ngagharịiwe,"Nnukwu Ụkọchụkwụ ụka Katọlik nke Enugwu Dayọsịs bụ Bishọpụ Calistus Onaga enyela ndị ụka ya ọpịpịa abalị asaa maka ""imetọ ọlta nchụaja Chukwu.""","N'akwụkwọ ozi o binyere aka ya nke o zigara ndị parish ụka nọ n'okpuru ya ụbọchị Tọzde, abalị isii nke ọnwa Mee afọ 2021, Bishọpụ Onaga kwuru na ọpịpịa bụ maka ""iji kwụ ụgwọ maka mmerụ ndị na-eso Father Ejike Mbaka merụrụ alta ebe nchụaja nke Ụka."" Ọ sịrị: "" N'abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021, ndị na-eso Fada Camillus Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu ji tigbo zogbuo wakpoo Katidral ma merụọ ọlta nso nke nchụaja ma mebikwa ihe n'ụlọ Bishopụ nakwa ụlọrụ nke dayọsis."" Onaga kporo ndị ụka Katọlik oku sị, ""Ya mere ana m akpo oku ekpere otu izuụka maka mmekwa na ịkwụ ụgwọ arụ e mere megide ebe ofufe nsọ nke ụka malite n'ụbọchị Fraide, abalị asaa nke ọnwa Mee rue abalị 14,2021."" Bishọp Callistus Onaga bụ Bishọp na-achịkọta Enugwu Ekpere e nyere ha maka ọpịpịa gụnyere Abụọma 51 na 23, na roziri. Cheta na ndị na-eso Fada Ejike Mbaka mere ngagharịiwe wakpo ụlọ Bishop nakwa Ụlọụka Holy Ghost Cathedral dịka ha mere ngagharịiwe na-achọ Mbaka bụ onye ndu Adoration Ministry Enugwu."" Ihe ndị mere ngagharịiwe mebiri n'ụlọ Bishop Onaga, Holy Ghost Cathedral Ụgbọala e mebiri na Holy Ghost Cathedral,Enugwu Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi gara n'ụlọ Bishọp Ụka Katọlik nke Dayọsịs bụ Calixtus Onaga ụbọchị Tọọzde ịhụ etu e si mebie ihe dịka e mere ngagharịiwe n'ihi Fada Ejike Mbaka na steeti ahụ ụnyaahụ. Ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'Enugwu ụbọchị Wenezde dịka akụkọ fegharịrị na a na-achọ Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministry achọ mana e mechara Fada Mbaka gbaa ka okwe ma gwa ọha ndị na-achọ ya okwu. Ụka Katọlik na dayosis Enugwu nyeburu Mbaka ntụzịaka ya nọpụ n'ime ụlọ n'ime ekpere na ntụgharịuche, ma hapụ ikwu maasị maọbụ rụọ ọrụ ọzọ abalị iri atọ. Ọ bụ ka ọ gachara abalị abụọ Mbaka nọ n'ọnọdụ nnọpụ ahụ ka ndị na-eso ya bịara ekpere 'Adọration', ndị ọrụ ha gwa ha na anya ahụbeghị ya abalị abụọ kemgbe Ọnaga kpọchara ya n'ekwentị ka ha ji malite ngagharịiwe. Onye ntaakụkọ anyị n'ụlọụka 'Holy Ghost Cathedral' dị n'Ogui na n'ụlọ Bishọpụ ụka Katọlik bụ Calixtus Onaga dị na Independent Layout, Enugwu ụbọchị Tọzde ndị ngagharịiwe ahụ mebiri ọtụtụ ihe. Ihe ndị ha mebiri gụnyere ụgbọala anọ,ọtụtụ igbentụ oyi, agbatị mposhi nke Bekee kpọrọ WC n'ịchafụ, mpio ugegbe, tankị mmiri, ingini na-enye ọkụ na ihe ndị ọzọ. Ụlọ Mposhi dị na Holy Ghost Cathedral Ka ọ dị ugbua, ebe niile ederela jụụ n'ụlọ bishọpụ nakwa ụlọụka 'Holy Ghost Cathedral.' Ọ na-ewe ha iwe, ngwa ha wepu Ngozi m goziri Nnamdi Kanu Onye ndu Adoration Ministry bụ Father Ejike Mbaka kwuru na ọ bụ maka ngọzị ọ gọzịrị Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob nakwa okwu o kwuru maka ọchịchị ka ejiri sị ya hapụ ụka ya ruo abalị 30. Mbaka kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ụka ya okwu n'Enugu dịka ọ pụtara ihe n'azụ ndị ụka ya sị na ọ na-efu efu. Mbaka sị: ""Ha nyere m iwu ka m hapụ Adoration ruo abalị 30; ka m ghara ikwu okwu ruo abalị 30 ma hapụ Enugwu."" Ọ sịkwa na ndị isi ya naakpa nkata etu ha ga-esi kpọrọ ya gawa Rome ma abalị 30 ahụ gachaa. ""A jụrụ m ha ihe mere ha jiri ata m ahụhụ a. Ha enweghi ikike ịgwa m onye m ga-agọzị. Ha na-ewe iwe na m gosiri Nnmadi Kanu. Ọ bụ ngọzị nke ha? Ọ bụ gị na-enye ya ndụ? Ga wepụ ngọzị Chukwa n'isi ya. ""Yabụrụ na ị na-ekwu na m na-akatọ gọọmentị maka etu nchekwa esighi dị, ha a na-ewe iwe na m sị ka gọọmentị nye ntoroọbịa ọrụ? A bụ ụkọchukwu, aga m na-ekwu eziokwu."" Mbaka sịkwa na ya gwara ndịisi ụka na nsogbu nwekwaraike ịdị ma ya bụrụ na ndị ụka ya chọrọ ya achọ. ""Ọ gịnị karị ime ma ya bụrụ na m rapụrụ Enugwu etu ha siri manye? Anyị bụ ndị udo, nke mere m jiri chọọ ka unu na-eruwe isi. Anyị ga-ezute ebe oge ụka ma ya bụrụ na Chukwu kwere,"" bụ okwu Mbaka gwakwara ndị ụka ya. Ọ bụghị DSS nwụchịrị m Mbaka sịka na aka ndị uweojii nzuzo (DSS) adịghị na ọchịchọ a chọrọ taa n'Enugwu. N'okwu mbụ o kwuru kemgbe akụkọ fegharịrị na a na-achọ ya achọ, Mbaka gwara ndị gbakọrọ n'umuchigbo, Emene Enugwu maka ekpere 'Adoration' na ọ bụghị ndị 'DSS' jichiri ya dịka ụfọdụ na-atụ uche. Igwe mmadụ mere ngagharịiwe n'Enugwu, Isiobodo Enugwu steeti etiti ụbọchị Wenezde dịka akụkọ fegharịrị na a na-achọ Fada Mbaka achọ kemgbe abalị abụọ. N'ozi o ziri n'abalị Wenezde, Mbaka, kelere ndị ihe ya na-amasị maka ""ịhụnanya ụnụ gosiri m dị m obi ụtọ."" O kwuru sị na ọ bụ oku ndị ụka kpọrọ ka ya gara ịza tupu a kpọ ya oku ka ọ pụta ka ndị mmadụ hụ ya iji gbochie ọgbaghara ịdapụta. O kwukwara na ụka kpebiri ka ọ kwụsịtụ ekpere adoration ruo abalị iri atọ. O kelere Chukwu na ndị tigbuo-zogbuo ezubanyeghị na ngagharịiwe ahụ e mere dịka a na-achọ ya, mebie ihe. O kelere ndị otu Ohaneze maka igosi ya nkwado ka ọ na-akpọtụ. Fr Ejike Mbaka ọ na-efu efu? Enugwu daburu ghara ghara dịka puku kwuru puku ndị mmadụ jụpụtara ama taa bụ Wenezde na-eme ngagharịiwe dịka a na-achọ Father Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu kemgbe abalị abụọ. Akụkọ na Fada Mbaka na-efu na-abịa abalị ole na ole ọ kpọrọ oku ka a chụtuo Muhammadu Buhari n'ọkwa Ọchịchị dịka onyeisiala n'ihi ndakpọ ọnọdụ nchekwa na Naijiria. Dịka ha nụrụ ya bụ akụkọ nke e ji igwe na-ekwu okwu maa ọkwa ya, ọtụtụ ndị bịara ekpere 'Adoration' nke Fada Mbaka na-ehiwe kwa Wenezde zọpụrụ n'iwe gawa bee Bishop Calistus Onaga. Ndị na-eso Mbaka ji akwụkwọ ndụndụ na egwu agha na-akpọ oku ka ha a kpọpụtara ha Father Mbaka. Ihe ụfọdụ na-ekwu bụ ""Ihe anyị na-akpo oku bụ ka ha kpọpụtara anyị Daddy anyị; Ihe niile abụghị 'politics, bikonu kpọpụtara anyị Fada Mbaka."" Ndị hụrụ ya anya ikpe ahụ kwuru na ọ bụ abalị abụọ gara aga ka a hụrụ. Ọ gwara ndị dị ya nso na ya na-aga ụlọ Archibishop Ụka Katọlik nke Enugwu bụ Onaga ịga zaa oku ọkpọrọ ya n'ekwentị mana a hụghịkwa ya ọzọ nke a na-alụ ozi ya. Oge BBC gara n'ogige ya, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ gụnyere ndị bịara Adoration ụbọchị Wenezde, na-ajụ ese ya. Ndị mmadụ gbakọrọ maka ekpere 'Adoration' nọ na 'gbagharịa' n'ihi kepukepu na Fada Mbaka na-efu efu Mbọ BBC gbara ji nweta nke bụ eziokwu banyere okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ. Odeakwụkwọ Katọlik dayọsịs nke Enugwu bụ Fada Bajamin Achi kwuru na ya amaghị maka akụkọ ahụ mana ya ga-ajụ ese nke bụ eziokwu. Ndị ihe Fada Mbaka na-amasị meere ngagharịiwe gawa n'ụlọ bishọpụ ụka Katọlik nke Enugwu Otu Fada dị Mbaka nso na-achọghị ka a kpọ aha ya kwukwara na ya amaghị maka ya mana ọ zaghị ekwentị ya. Kirie ka o si aga dịka ndị na-eso Mbaka mere ngagharịiwe gawa n'ụlọ Achibishọpụ Enugwu bụ Most Rev. Callistus Valentine Onaga: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: Onye ọbụla tiri agadi ihe n'Ogidi ga-ata nnukwu ahụhụ" afirika-50021889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50021889,King Jaja of Opobo: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbara afọ 12,BBC Igbo gara Amaigbo ijupụta ụmụnne nwafọ Igbo a ama dịka King Jaja nke Opobo ka ha sị mata na ha na nwa amadị a bụ Nwanne.,"Ọ rụọla agbụru atọ kemgbe Mbanaso bụ onye amaara dịka Jugbo Jugbo n'Opobo furu. Bekee tụgharịri ya bụ aha kpọwazịa ya Jaja maka na ha enweghị ike ịkpọli Jugbo Jugbo. BBC Igbo na nwa nwanne Jaja bụ Duruoshiri nke abụọ nwere mkparịta ụka na nchete nwaanne ha bụ Mbanaso. Duruoshimiri tọturu anyị abọ ka Nna ya siri kọwaara ha maka Mbanaso na ka esi tọrọ ya, nakwa ka ha sị mata na ọ ka dị ndụ. Ọrụ a sị n'aka Chris Sanctus Okereke. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-55451654,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55451654,Bishop Kukah nwere ikike ikpere Chi ya n'ụzọ ọbụla - Garba Shehu,Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla otu Muslim Solidarity Forum maka ịsị na ha ga-achụpụ Bishọp Mathew Kukah na Sokoto.,"Otu Muslim Solidarity Forum yiri Bishop Kukah egwu a maka ihe o kwuru banyere ọchịchị onyeisiala Buhari n'ozi afọ ọhụrụ ya. Ha sị na Bishop Kukah ga-arịọ onyeisiala Buhari na ụka alakụba mgbaghara maka okwu ya ma ọ bụghị ya ha enye ya ọsọ na Sokoto. Mana Garba Shehu bụ onye enyemaka Buhari n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Wenezde sị na Bishọp Kukah nwere ikike okpukperechi nke ya dịka iwu Naịjirịa si dị. Na-agbanyeghi na okwu ya megidere ụfọdụ mmadụ dịka Buhari mana onye ọbụla nwere ikike ikwu uche ya n'iwu Naịjirịa. Na nzaghachị, Bishop Kukah sị na ọ ga-arịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na e gosi ya etu o siri mejọọ okpukperechi alakụba. Bishop Kukah abụghị atụrụ e ji achụ aja - PFN Otu jiikọrọ ndị ụka agba ọhụrụ Bekee kpọrọ 'President of the Pentecostal Fellowship of Nigeria' (PFN) agwaala ndị na-akatọ nnukwu ụkọchukwu Katolik na Dayọsis Sokoto bụ Bishop Matthew Kukah ka ha sepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọ aka mmadụ. N'ozi o zirị ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde, na Benin, onyeisi PFN bụ Felix Omobude kwuru na ihe Bishop Kukah kwuru banyere ọnọdụ na Naijjiria na ọchịchị Buhari bụ ""ịgwa ndị nọ n'ọchịchị eziokwu."" Bishop Kukah nọrọ n'oziọma o ziri ụbọchị Ekeresime afọ 2020 katọọ ọchịchị Buhari maka otu o si akpa oke n'etiti Ugwu na ndịda Anynawnụ nakwa maka nsogbu enweghị nchekwa nke butere ụfọdụ ịkatọ ya. Mana PFN site n'ọnụ Omobudu kwuru na ""o kwesiri ka eto ya maka ikwupụta uche ụmụ Naijiria kama ịgba nkitị ụfọdụ na-agba ihe a na-emebi."" Omobude kpọrọ oku ka a hụta Kukah dịka ""onye hụrụ ala nna ya n'anya, na ọ bụghị dịka atụrụ eji achụ aja."" ọ gara n'ihu sị na Kukah""abụghị onye kpọrọ gọọmenti asị, ọ bụ onye hụrụ eziokwu n'anya."" Okwu PFN na-abịa dịka otu Muslim Rights Concern(MURIC) kpọrọ oku ka Kukah wepụ onwe ya dịka odeakwụkwọ n'otu e kpokọbara maka ikpe udo na Naijiria a kpọrọ Nigeria's 'Peace Committee' na Bekee. Otu ahụ site n'ọnụ onyeisi ha bụ Akintola boro Kuka ebubo na o nweghị obi ọcha n'ebe ndị ụka alakụba nọ. Ihe ọbụla mere Bishop Kukah, Buhari ka anyị ga-ejide - ECWA Ndị ụka Evangelical Church Winning All (ECWA) akpọkuola otu mba ụwa nakwa mba dị icheiche ka ha jide Onyeisiala Muhammadu Buhari ma ọ bụrụ na ihe ọjọọ ọbụla mee Bishop Mathew Kukah. Nke a na-abịa dịka otu ndị ntorobịa mpaghara Ugwu kpọrọ oku ka a nwuchie Bishop Kukah maka ihe o dere n'ozi Ekeresimesi ya. Odeakwụkwọ ndị ECWA bụ Yunusa Sabo Nmadu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde. Sabo Nmadu kwuru sị: ""Bishop Kukah kwuru ihe dị anyị niile n'obi, anyị agaghị agba nkịtị ka gọọmentị maọbụ onye ọbụla mekpaa ya ahụ."" ""Anyị agaghị anabatazi ụdị ọchịchị Muhammadu Buhari a nke bụ onye kwuo okwu a sị jide ya gbuo."" ""Anyị na-akpọku mba ụwa dị icheiche nakwa ndị Naịjirịa ka ha jide Buhari ma ihe ọbụla mee Bishop Kukah."" ""Kama ịchọ ụzọ isi mekpaa Bishop Kukah ahụ, gọọmentị etiti kwesịrị ịgba mbọ mezie mperi niie ahụ Kukah depụtara n'ozi ya. Bishop Mathew Hassan Kukah Taa bụ ụbọchị nke anọ kemgbe nnukwu ụkọchukwu ụka Katọlik bụ Bishop Mathew Kukah wepụtara ozi Ekeresimesi ya ebe ọ nọrọ katọọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ihe ọ kpọrọ 'oke ịkpa oke"". Mana aha Kukah ka na-ada ụda na soshal midia n'ihi ozi ya nakwa etu ọtụtụ ndị si ghọta ya. Bishọpụ Paulinus Ezeokafor etinyela ọnụ na ngagharịiwe END SARS Iji maa atụ, gọọmentị etiti, site n'ọnụ Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, dọrọ ndị isi ụka aka na ntị ka ha sepụ aka na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ndị isi otu ndị ntorobịa nke mpaghara Ugwu, bụ 'Arewa Youth Consultative Forum' kpọrọ oku ka a nwuchie Kukah ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ikwu okwu nwere ike ibute ọgbaaghara. Mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa kwuru na okwu Bishop Kukah dịka afọ ime nke mmadụ agaghị ekpuchinwu aka. Lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru: Shehu Sani, onye bụbu Sịnetọ na-anọchite anya mpaghara 'Kaduna Central' gwara ndị ntorobịa Ugwu ka ha lekwasị anya n'ọnọdụ enweghị nchekwa dị na be ha ma kwụsị ịkatọ Bishop Kukah. N'aka nke ọzọ, Ben Murray-Bruce, onye bubu Sineto nọchitere otu mpaghara na Bayelsa steeti, kwuru na o wepụtala onwe ya iji kpee udo n'etiti Onyeisiala Buhari na Bishop Kukah. Mana Aisha Yesufu, bụ otu olu na-ekwusi okwu ike megide ọchịchị ọjọọ na Naịjirịa, kwuru na ihe dị mkpa abụghị ikpe udo ọbụla, kama ọ bụ ka Buhari rụọ ọrụ ya nke ọma dịka onyeisiala. Onweghị mgbe m ji kpọọ oku ka a chutuo Buhari - Kukah Bishọp Mathew Kukah na-akọwara ndị ntaakụkọ ihe o kwuru n'ozi Ekeresimesi ya n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na asatọ nke Disemba 2020. N'ọgbakọ ọ kpọrọ ndị ntaakụkọ na Sokoto n'ụbọchị Mọnde, Bishọp Kukah kọwara na ndị ntaakụkọ na-edehie ihe o kwuru ma na-ekwu nke o kwughị. O kwuru na onweghị mgbe o ji kwuo ka a chutuo Buhari dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ si ede. O gara n'ihu kwusie ike ihe o kwuru na ""ọ bụrụ onye si mpaghara ọzọ na-achị Naịjirịa etu Buhari si achị, a gaala ichutu onye ahụ"". Kukah kwuru na ya bụ onye Ugwu, nke pụtara na ọ kpọghị ndị Ugwu maọbụ ndị okpukperechi Alakuba, maọbụ onye ọbụla asị. Catholic na CAN akwadola Bishop Kukah n'okwu ọ gwara Buhari Otu jikọtara ndị ụka Kraịst na steetị iri na itoolu dị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa akwadola ihe Bishop Mathew Kukah kwuru maka ọchịchị Onyeisiala Buhari. Nke a dị n'akwụkwọ ozi osote onyeisi ndị CAN n'ugwu bụ John Hayab wepụtara ma sị ka okwu Bishop Kukah kwụ ọtọ ka sịga nke gosiri ọnọdụ Naịjirịa nọ n'ime ugbua. Ọ gara n'ihu sị na otu ọbụla anwakwala anwa tụgharịa okwu Bishop Kukah maka na ime nke a bụ imebisi obodo. Otu a sị na onweghi ihe ọbụla gosiri na Bishop Kukah chọrọ iweta nnapụ ọchịchị n'ike maọbụ megide okpukperechi Islam n'okwu ya dịka ụfọdụ ndị ji boo ya ebubo. N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik na Naịjirịa bụ Fada Mike Umoh gbarụrụ ihu maka ebubo a na-ebo Bishop Kukah na ọ chọrọ itinye ọgbaghara na ịkpa oke. Umoh sị na n'ihi ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na akụnaụba nke Naịjirịa, na ụka Katọlik na Naịjirịa kwadoro ihe Bishọp Kukah kwuru banyere ọnọdụ Naịjirịa. Umoh kwuru ""Dịka a tụrụ anya ya, ndị ọrụ ekwensu agbakọọla ịwakpo Bishop ma katọọ eziokwu niile o kwuru, nke a bụ ọrụ aka ndị ọjọọ. ""Mana ndị a na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ụka Kraịst gbaa nkịtị ma o nweghi ihe ha kwuru banyere ha. Ọ bụ n'ihi nke a ka anyị ji na-akpo ịdọnyere Bishọp Kukah ukwu."" Ihe Lai Mohammed gwara Bishop Kukah Lai Mohammed na Bishop Mathew Kukah Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed adọọla ndị isi ụka aka na ntị ka ha kwụsị ịgbasa ozi nwere ike ibute nkewa na Naịjirịa. Mohammed kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Satọde site n'aka onye enyemaka ya bụ Segun Adeyemi. Ọ bụ eziokwu na Mohammed akpọghị Kukah aha n'ozi ya, mana a tụọ ilu nkịrịka nkata, onye a gwara amarala. Mohammed kwuru sị: ""Ọ bụ eziokwu na ndị isi ụka nwere ọrụ ịgwa ndị ọchịchị eziokwu oge niile, o kwesighị ka eziokwu ahụ bụrụ nke e ji iwe kwuo, maọbụ nke ga-akpata ọgbaaghara na nkewa."" ""Ọ jọgburu onwe ya etu onye isi ụka ga-esi were oge Ekeresimesi na-agbasa ozi ga-ebute enweghị udo."" ""Ịkpọ oku ka a chutuo ọchịchị gọọmentị ọbụla nke e ji ntuliaka hibe, maọbụ ikwu okwu ga-ebute ọgbaaghara n'etiti okpukperechi abụọ, abụghị ihe e kwesịrị ịnụ n'ọnụ onye isi ụka ọbụla."" Mohammed gara n'ihu kwuo na ""nsogbu Naịjirịa na-agabiga ugbua bụ nke mmadụ niile ga-agbakọ aka chọta ihe a ga-eme ya, ọ bụghị nke otu onye ga na-atụ onye nke ọzọ aka maọbụ na-akpọ aha ọjọọ"". Onye abụghị onye ugwu chịa etu Buhari si achị, anyị ga-anọ n'agha ugbua - Kukah Bishọp Sokoto Dịosis bụ Mathew Kukah ekwuola na ọchịchị ịma mmadụ Onyeisiala Muhammadụ Buhari ji achị Naịjirịa bụ ihe mkpagbu diri ya bụ mba. Kukah, n'ozi Ekeresimesi ya kwuru na usoro ọchịchị Buhari bụ iwere ihe niile nye ndi ugwu ibe ya n'aka ma mee ndị agbụrụ ọzọ ka ha a bụ ndị esoghi nwere obodo bụ ihe ọ ma ama eme. Ọ sị na atụmatu a mere ka olieanya ọtụtụ ndi tụrụ Buhari vootu laa n'iyi. Kukah sị na ebe Buhari kwesiri ị na-agba mbọ ịhụ na Naịjirịa di n'otu, ọ na-agba mbọ ịhụ na ha yasara ayasa. N'ọnụ okwu ya, Kukah sị na ndị Naịjirịa niile ma na onweghi onye ọchịchị abụghị onye ugwu ga-emenwu ihe Buhari ji ịma mmadụ ya eme ma laa n'udo. Ọ sị: ""A karị ime ""coup"" kemgbe maọbụ anyị anọdụ n'agha."" Kukah si na ọ ga-abụ na Buhari ekpebiela na onweghi ihe ndị ofufe Kraịst na Naịjirịa ga-emenwu maka agwa ọ na-akpa, mana ọ sị na nke ahụ nwereike ịbụ eziokwu maka ha enweghị obi iji ọgbaghara yie mba ha egwu. Ọ sị na Chukwu adịghị atụ ụjọọ, makana agwa Buhari na-egosi n'Ugwu Naịjirịa. Kukah metụrụ ọnụ na ntọrị mmadụ mere na Kankara, nakwa mwakpo na enweghi nchekwa na-me n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa ugbua. BBC kpọrọ ndị na-ekwuru Buhari maka ihe a Kukah kwuru mana onweghi onye n'ime ha zara ekwenti ha" afirika-49085289,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49085289,Boris Johnson abụrụla Praịm Mịnịsta Briten,Boris Johnson abụrụla Praim Mịnịsta Briten.,"A kpọpụtala aha Boris Johnson dịka onye ga-anọchite anya Theresa May Wenzde ụbọchị 24 Julaị, 2019. Johnson ji vootu 92,153 merie Jeremy Hunt, onye nwetara 46,656. O nwere mgbe ọ fọzịrị Jeremy Hunt na Boris Johnson. N'okwu nnabata Johnson, ọ sị na ya na Jeremy Corbyn ga-etikọta aka wee rụọ ọrụ chere ha n'ihu: End of Twitter post, 1" afirika-44079942,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079942,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọgwụ ọhụrụ nwereike ị gwo Ebola na mba Congo,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Otu onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kpokobara na-abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị abanyela ya bụ ndọrọndọrọ n'ezie. Otu ahụ akpọrọ 'Coalition for African movement' malitere ikwado otu pati African Democratic Congress ADC n'aha ịchafụ. Ogwu Ebola Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba Congo ewuputala na ha ga eji ọgwụ ọhụrụ ha nabatara n'afọ gara aga iji gwọ ọrị Ebola malitere na bee ha. Ha kwuru nke a ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ gbagoro ruo iri n'abụọ. Ebe ọzọ n'Afrịka, Otu ụlọịkpe na mba Sudan amaala otụ nwaagboghọ ịkpe ọnwụ maka na o gburu dị n'ihi mwakpo dị ya wakporo ya ebe ụmụ nwanne dị ya jichiri ya n'ala. Okaịkpe n'obodo Omdurman mara ya ịkpe a ebe ezinaụlọ dị ya jụrụ ị nara ịkpe ọzọ n'abụghị nke gaewere ndụ nwaagboghọ ahụ. N'Egwuregwu. Mohammed Salah ritere ntuliugo abụọ bụ Player of the Season kachasi bụ n'emume ntuliugo otu egwuregwu bọọlụ Liverpool mere n'abali ụnya ahụ. Salah kwuru na ọdịnihụ ya ka siri ike na Liverpool ebe ọrụ ya ka na-ebido ebido. Ihe ọzọ ị kwesiri ị maa: Ụlọikpe etiti n'Abuja ụnyaahụ kagburu nkwụsị ọrụ ndị sineti mere sinetọ Ovie Omo-Agege rue mkpụrụ ụbọchị 90. Mana obi adịghị ndị sineti mma maka ikpe a ya mere ha ji achọ ime mkpesa ikpe ahụ. Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" egwuregwu-45074413,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45074413,FA Chelsea na Man City ga-achịpụ ya,Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Manchester City ga-ezute ibe n'ehihie a n'asọmpi Iko FA Community Sheild.,"Asọmpi a bụ nke na-adị n'etiti ndị mabutere iko asọmpi premier na ndi mabutere iko FA ndị mba ỊngLand. Cheta n'oge asọmpi gara aga, ndị Manchester City maburu Iko asọmpi Premier ebe ndị Chelsea maburu nke asọmpi FA. Asọmpi a ga-amalite ma ọ kụọ elekere abụọ nke uhuru chi taa n'ọgbọ egwuregwu wembley nke Ịngland. A na-atụ anya na Mahrez nke Man City na Jorginho nke Chelsea ga-amalite asọmpi nke taa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43130019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43130019,Unicef ekwuola na Naịjirịa bụ 11 n'ụwa n'ọnwụ ụmụaka,"Ndị otu United Nations Children Fund (Unicef), wepụtara akwụkwọ gosiri na Naịjịrịa nọ n'ọkwa 11 gbasara ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ, n'ụwa.","Unicef kwuru sị na ihe ruru ọkara ụmụaka amụrụ n'ime afọ ọhụrụ a ga-anwụ Ha kwuru na ụmụaka iri abụọ na itoolu na-anwụ n'ime otu puku amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa kwa mgbe. Ụfọdụ ihe ndị na-eme ka nwa amụrụ ọhụrụ nwụọ bụ ụbịam, ajọọ nlekọta n'ụlọọgwụ na agha. Akụkọ ahụ gosiri na ọnụọgụgụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ nwụrụ na Naịjirịa ebelatala mana a ka ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na ha chọrọ imezu ihe ha kpọrọ Sustainable Development Goals. Unicef kwukwara na mpaghara sub-saharan Afịrịka bụ ndị asatọ n'ime iri ebe ndị jọrọ njọ nne nwere ike ịmụ nwa ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45975226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45975226,Nnamdi Kanu na ndị ọzọ gbafuru mgbe a na-achọ ha na-ejighi akwụkwọ njem,Ụlọikpe ala Naịjirịa atọhapuola Ayodele Fayose.,"Ruo ugbua gọọmentị Naịjirịa enwebeghike ịkọwa etu ihe a siri mee Mana tupu atọhapụ ya, ọ kwụrụ ụgwọ ruru nde naịra 50. Ụlọikpe napụ kwa ya akwụkwọ ikike njem nke Bekee kpọrọ ''International Passport'' Ayodele Fayose bubu gọvanọ Ekiti steeti Mana n'ime akụkọ a, anyị chọrọ ịhọpụta mmadụ kpuru akpụ na mba Naịjirịa sị ala gawa ala ndị ọzọ nanị iji akwụkwọ ikike ọbụla. Nnamdi Kanu Kanu bu nna ndị otu Ipob na Naịjirịa. N'ụbọchị September 11, 2017, ndị agha Naịjirịa batara bee ya na Afaraukwu n'Abia steeti. Mana onweghị onye hụrụ ya na-ebe ahụ. Nnamdi Kanu ka na-ekwusi ike maka ebumnuche Ipob gbasara referendum Ọ kariri ọnwa iri na atọ tupu foto ya apụta n'elu facebook kọwara na ọ nọrọ na mba Izrel. Ọ nweghị onye mara ka o si fepu na Naịjirịa wụbanye na Izrel. Diepreye Alamieyeseigha Alamieyeseigha chịbụrụ dịka gọvanọ Bayelsa steeti na etiti afọ 1999 ruo 2005. Dịka ndị ọzọ Alamieyeseigha gọrọ ebubo a niile Mana ndị mba Britain boro ya ebubo nrụrụaka, ha kpere ya n'ụlọikpe mana tupu ha tabie anya ha nụrụ na Alamieyeseigha awụọla dịka awọ na Naịjirịa. Kepu kepu mgbe ahụ na-ekwu na Alamieyeseigha yiri akwa dị ka nwanyị ka o nwere gbanwe onwe ya, mana Alamieyeseigha kwusiri ike na onweghị eziokwu dị n'okwu a. Alamieyeseigha nwụrụ na ụbọchị 10 October n'afọ 2015 na bee ya na Bayelsa. Diezani Alison-Madueke Diezani bụ onye bubu Minista na-ahu maka mmanụ agbịdị n'etiti afọ 2017 na 2015. Mana n'afọ 2015, ọtụtụ ebubo nrụrụ aka pụtara n'isi Deziani. Gọọmentị Naịjirịa kpachiri ego ruru ijeri 7.6b nke a na-ebo na ọ bụ ego Diezani. Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi EFCC kpachịkwa ụlọ ya dị n'Abuja ebe maka ebubo a dị ya n'isi. Mana a ka na-ekwu nke a oge a nụrụ na o ruola mba UK. Akụkọ ikpeazụ ndị Naịjirịa nụrụ maka ya bụ na ọ na-arịa ọrịa kansa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48912739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48912739,Akwete fabric: Etu ndị Akwete si malite ịkpa akwa,Nwaanyị na-akpa Akwaete bụ Gladys Akuatta kọwaara BBC Igbo etu ịkpa akwa a si malite n'obodo ha.,O kwuru na ọ bụ nwaanyị a kpọrọ Dada Nwakata malitere ịkpa akwa site n'ihe e gosiri ya n'ime nrọ. Na ọ pụtara n'ihe malite ịkpa akwa a nke nwaanyị ọbụla n'obodo Akwaete bịara mụta ịkpa ya n'oge ahụ. Gladys gara n'ihu kwuo na ha anaghị akụziri onye na abụghị onye Akwaete etu esi akpa akwa a n'ihi na ọ gaghị amụta ya. Na nke a bụ iwu e tinyere n'obodo Akwaete gbaa gburugburu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-53349841,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53349841,"Ibrahim Magu: Orji Kalu, na gọvanọ atọ si aka ya gaa nga",Oge Ibrahim Magụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) dịka ihe gaferela ka onyeisiala Muhammadu Buhari sị ka were ọsọ ọsọ laa ezumike nwa mgbe nta iji nye ohere ka e mee ya nnyocha ọfụma.,"Mohammed Umar arịala dịka onye nnọchite anya Magu. Nke a na-eme dịka a na-enyocha Magu maka ebubo nnupu isi na izuaghari akụnaụba a natara ndị mmadụ ikpe nrụrụaka mara. Ọ bụ n'ụbọchị Monde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun ka Magu zara oku nnyocha Kọmiti onyeisiala hibere kpọrọ ya. Kemgbe ahụ ọ nọ n'aka ndụ ọrụ nchekwa. Okwu Magu dara ka dinta a na-achụ nta ya makana kemgbe onyeisiala Buhari were ya n'ọrụ dịka onyeisi EFCC n'afọ 2015 ọ bụ ya na-ahazi agha gọọmenti na-ebuso mpụ na nrụrụaka. N'ihu ọrụ a, ọ kpọchịrị ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa gbalitere ma tụọ ụfọdụ n'ime ha nga dịka ụlọikpe mara ha ikpe ohi ego ọha. Lee ụfọdụ ndị a gara nga site n'aka Magu: Uzor Kalu Orji Kalu gara nga ka ikpe mara ya banyere ebubo ohi ijere naịra 7.65 nke metụtakwara onye bu Kọmịshọna na-ahu maka ego oge ọ na-achị Abia steeti. N'ụbọchị ise nke ọnwa Decemba 2019 ka Ọkaikpe Mohammed Idris tụrụ Kalu nga afọ 12, mana Ụlọikpe Ukwu mechara tọghapụ ya. Kalu akpụpụla EFCC ụlọikpe ugbua maka okwu ahụ. Bala Ngilari Bala Ngilari bụbu aka na-achị Adamawa steeti. A tụrụ ya nga afọ ise maka ebubo nrụrụaka oge ọ na-achị dịka gọvanọ. EFCC boro ya na mmadụ abụọ ọzọ ebubo na ya nyere ndị mmadụ ohere ịrụ ọrụ ruru nde dọla 167 n'ụzọ na-ezighi ezi. Otu ụlọikpe dị na Yola mara gọvanọ ahụ ikpe ma tụọ ya nga afọ ise mana ụlọikpe mkpegharị kagburu mkpebi ahụ ma sịkwa na ebubo ahu enweghi isi na ọdụ. Jolly Nyame A tụrụ Jolly Nyame nga afọ 14 ka ikpe nrụrụaka banyere ego ọha mara ya. Ngalaba EFCC si na Nyame zuru ego ọha site n'afọ 1999 rue 2007 bụ oge ọ na-achị dịka gọvanọ. Ọkaikpe Adebukola Banjoko sị na EFCC, n'oge nke Magu, nwere akaebe kwụ ọtọ na Nyame mefuru ego ruru ijere dọla 1.6. Ụlọikpe Mkpesa na nke Ukwu sị na ikpe mbụ e kpere Nyame kwụ ọtọ. Nyame nọ na mkpọrọ ugbua n'ihi mkpebi ahụ. Joshua Dariye N'afọ 2007, EFCC boro Joshua Dariye, bụbụ aka na-achị Platu steeti ebubo na aka ya dị na nrụrụaka banyere izu nde naịra 121 n'akpa ego steeti ahụ. EFCC sị na ọ bụ site n'aka ụlọọrụ a kpọrọ 'Ebenezer Reitner Ventures' ka a kpara ike ahụ. Ha sịkwa na aha ụlọọrụ a adịghị n'akwụkwọ gọọmentị. Ka afọ iri gachara, Ọkaikpe Banjoko tụrụ ya nga afọ 16. Ụlọikpe Ukwu mechara wetuo afọ ole ọ ga-anọ site 16 ruo afọ iri. Ọ ka fọrọ Dariye afọ anọ ịnọcha na nga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44782250,https://www.bbc.com/igbo/44782250,Ebidola usoro ichutu osote gọvanọ Imo steeti n'oche - TOE Ekechi,"N'oge na-adịghị anya, Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo steeti nwere ike ịbụ onye na-enweghị ọrụ ọzọ.","TOE Ekechi gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ụlọomeiwu nke Imo Steeti na-akwado ichutu Madumere. Akụkọ kwuru na ndị omeiwu na-ebo Madumere ebubo oke nrụrụaka. Maka nke a, e hibere kọmitii mmadụ isii ga-etinye uchu n'inyocha ebubo ndị a e boro ya ma gwakwa ndị ụlọomeiwu n'ime ụbọchị asaa. Gee ihe Ekechi nwere ikwu gbasara ihe a n'uju ebe a: Etu e si chọọ ichutu Eze Madumere n'oche osote gọvanọ Imo steeti" egwuregwu-47975132,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47975132,Chelsea vs Burnley FC: Chelsea agbọghị ụja n'azụ ụlọ ha,"Egwu a malitere n'oge tụwa nkọ dịka Burnley ji nkeji asatọ e ji malite egwuregwu were tinye goolu mbụ Jeff Hendrick ji goolu ahụ mee Chelsea ""ị makwa ndị anyị bụ"".","Chelsea na Burnley Na-erughi nkeji anọ nke a mechara, Eden Hazard buru nri chinyere bunye N'Golo Kante; onye ji ya gbakaa neetị iji nweta goolu mbụ Chelsea ma gwa ha ""kpachara anya makana ọ bụ be anyị ka unu bịara"". Na-erughikwa nkeji abụọ ọzọ (14""), Gonzalo Higuain nke Chelsea buba goolu ọzọ na mpio Burnley. Ndị Burnley ekweghi Chelsea kute ume ndụ, ka ha sara ya bụ goolu na nkeji 24. Ashley Barnes sara goolu ahụ mere ka ụzụ tụọ na poostu Chelsea. Calum Hudson-Odoi nakwa Kante mechara pụọ ka ha merụrụ ahụ. Mana asọmpi a kpụ ọkụ n'ọnụ biri na goolu abụọ abụọ, n'agbanyeghị mbọ niile Chelsea gbara ịtụkwasị ọzọ. Mmeri a emeela ka Chelsea rifere Arsenal ma nọrọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League. Akụkọ ga-amasị gị Killiwee Nwachukwu" afirika-44356774,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44356774,Triplets after 19 years: Ị hụtụla ụdị ọrụ ebube a?,"Mgbe Pastọ Don Ọdụnze na Oriakụ ya bụ Ogechi Ọdụnze chere na oge ịmụ nwa ha agafela, ha mụrụ ejịma atọ, ụmụ nwoke abụọ na otu nwanyị.","Mgbe BBC Igbo bịara n'ụlọ ya n'Enugwu, Pastọ Ọdụnze jiri egwu ọṅụ na-eto Chukwu ma nyekwa ndị na-achọ nwa ndụmọdụ ka ha tụkwasa chukwu obi n'ihi na ọ naghị agharịpụ onye ọbụla tụkwasịrị obi na ya. Nne Ejima atọ Ogechi Odụnze kọrọ ka ụmụ nwaanyị ibe ya siri na-eme ya akaja na ya na dị ya na-ekpere ndị ọzọ ekpere mana ha apụghị ikpepụta onwe ha. Don Odunze na Ogechi nwunye ya nọzị ugbua na-enwere aṅụrị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45675437,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45675437,Ntuliaka imeụlọ APC ga-abụzi ụbọchị Sepụtemba 30,"Kọmitii ojezi nke etiti otu pati APC agbanwela ụbọchị ntuliaka imeụlọ otu APC kwadoburu ime echi bụ Satọde, abalị 29 nke ọnwa Sepụtemba 2018.","Ntuliaka ahụ ga-abụzị ụbọchị ụka bụ abalị 30, ọnwa Sepụtemba. Ọkwa dị n'akwụkwọ mgbasaozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi APC bụ Yekini Nabena binyere aka na ya ma zitere ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Toosde. Ozi ahụ kwuru na ntuliaka imeụlọ ndị ọzọ ga-adị ka e siri hibebuo ya. * Oktoba 2, 2018 - Ntuliaka maka ọkwa Sineti * Oktoba 3, 2018 - Ntuliaka maka ụlọomeiwu nta * Oktoba 4, 2018 - Ntuliaka maka ndị ga-aga ụlọomeiwu nke steeti * Oktoba 6, 2018 - Ọgbakọ zuzugbe maka ọkwa onyeisiala Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48825160,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48825160,Nigerian Embassy : 'Nne Leah Sharibu bụ ọnye asi',"Nnọchiteanya Naijirịa na USA apụtala katọọ ọgbakọ ndị a na-akpọ 'The Heritage Foundation' nke Amerika mere maka igba ama nke ha kpọrọ "" Enweghị Nchekwa na Naịjirịa: Okwu ndị akaebe""","Ndị Ezinụlọ Leah Sharibu Ndị a kpọrọ bịa mee mkpesa a bu Rebecca Shaibu ( Nne Leah Shaibu), Alheri Bawa Magaji na Napoleon Adamu. Nnọchịta anya Naijiria na USA kwuru na ndị biara gbaa ama n'ọgbakọ ahu juputara na asị ma bụrụ kwa ndị nwere obi ọjọọ ebe gọọmentị Naijirịa nọ. Ndị Boko Haram tọrọ ụmụnwaanyị ụmụakwụkwọ n'afọ 2013 Ha na-ekwukwa na mgbe ọzọ ka ndị otu 'The Heritage Foundation' gbalịa mee ka ndị gọọmentị Naịjirịa soro n'ọgbakọ a ka ha nwere ike zara isi onwe ha. Chetakwa na Leah Sharibu soro na ụmụaka akwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ ma ha ekweghi ihapu ya mbge ha hapụrụ ndị ọzọ n'ihi na Leah ekweghị ịhapụ okwukwe ya dịka onye nke Kraịst. Akụkọ ga-amasị gị ." afirika-44429474,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44429474,Russia 2018: Ọgụ 'rimotu' ebidola n'ezinaụlọ ndị a,Ọfọdụrụ ụbọchị anọ ka e bido gbawa bọọlụ iko mbaụwa na Russia.,N'ime ihe nkiri a egwuregwu boọlụ a wetere esemokwu n'etiti ụmụnne nakwa dị na nwunye. Kirie ya n'uju ka ị chọpụta ka osi mee. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-46237002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46237002,Ọja Festival 2018: Mgbe asụsụ Igbo turu ugo,BBC Igbo gara emume ọja n'Enugwu nke afọ a.,Kirie ihe anyị hụru na ya bu emume eji akwalite asụsụ na omenala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-56188676,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56188676,"George Obiozor Video: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị - Ohaneze ndị Igbo","""Nnamdi Kanu bụ nwa anyị nwoke, ọ bụ otu n'ime anyị, ọ ga-egerịrị ntị ma mee ihe anyị gwara ya.""",Nke a bụ okwu Ọkammụta George Obiozor kwuru n'ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ Ohaneze Ndigbo nke ngalaba Legọs. George Obiozor kwukwara na ndị Igbo achọghị ịpụ na Naịjirịa n'ihi na onweghị okwu ọbụla na-esere ha na Naịjirịa. Ọ gara n'ihu kwuo na okwu gbasara Biafra abụghị okwu ndị ntorobịa ga-etinye ọnụ n'ihi na ọ karịrị ha. Gere ya n'uju n'onyonyo a. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-48002021,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48002021,Gombe accident: Ụgbọala akugbuola ụmụaka Boys' Brigade iri na-eme ngagharị 'Easter',Akụkọ anyi ji mere ọji ụtụtụ,"Ụmụ Boys' Brigade na Gombe Ụgbọala akugbuola ụmụaka Boy's Brigade mmadụ iri dịka ha na-eme eme ngagharị 'Easter',ebe mmadụ iri atọ merụru ahụ na Gombe steeti dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe steeti bụ Mary Malum si gwaa BBC Igbo. Ụmụaka ndị a sị St Peter's Anglican Church nakwa Bamusa nọ Ụlọọgwụ Gombe Specialist Hospital ugbua a na-anata ọgwụgwọ. Igbo na Yoruba bụ Nwanne Ooni nke Ife Oba Adeyeye Ogunwusi Ooni nke Ife, Oba Adeyeye Ogunwusi ekwusiela ike na ndị Yoroba na Igbo bụ ụmụnwanne sị otu afọ nke bụ na o nweghị nkesa. Oba Ogunwusi onye kwuru nke a oge ọ nabatara Onyeisi Ohaneze ndị Igbo Lagos bụ Solomon Ogbonna n'obi gwara Ndịgbo ha wụsa ahụ na Legọs na ""uyo bụ uyo maa gị"". Ogbunigwe Sri Lanka Ndị mmadụ na-etị na-ebe na Sri Lanka N'ofesi, ọnụọgụgụ ndị mmadụ nwụrụ n'ogbunikwe Sri Lanka achụwala narị atọ ugbua. Agbanyeghị na o nwebeghị otu kwetara n' aka ha dị na ya, gọọmentị obodo ahụ na-arụjere ndị ajo otu ọhụrụ a kpọrọ, National Thowheed Jamath dịka ndị nwere ike ịkpa ya bụ agwa ọjọọ. Chelsea na Burnely ga-akwata tata N'egwuruegwu, dịka ndị otu egwu bọọlụ dị iche iche na-achịpụ ya n' asọmpị Champions League, ndị Chelsea na Burnley na-eke nkwụcha ikwakọrịta mpi n' asọmpi Premier League tata. Ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ na elekere asatọ nke abalịa ga-eme ka ndị Chelsea wụgoro na ogogo nke atọ ma ha merie. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Abụm onye Naijirịa - Atiku Onye zọrọ ọchịchi onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar akọwara ihe mere ya jiri tozuo ịzọ ọkwa dịka onyeisiala Naijirịa. Na nkọwa Atiku, atụmatụ pati no na ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) wepụtara na ya abụghị onye Naịjirịa adabaghi manacha makana nne na nna ya bu ndị Naịjirịa kpọmkwem. Dịka, amụrụ ha na Naịjirịa. Atiku si na nne ya bu onye Dutse nke di na Jigawa Steeti, ebe nna ya bụ onye Wumo di na Sokoto steeti. Volodymyr Zelensky and his supporters celebrate winning Ukraine's presidential election Onye ọkpa ọchi buzi onyeisiala Ukraine Ọkwa egwuregwu egwuregwu ka ojiri sonye na achụmta vootu ịbụrụ onye isiala Ukraine Mana Volodymyr Zelensky abụrụla onyeisiala n'ezie ka ndị Ukraine si na etu osi mee ka onyeisiala n'ihe onyonyo masiri ha, ya bịa mee ya n'ezie. Ụlọụka atọ so n'ebe awakporo Mmadụ 290 anwụọla na mwakpo Sri Lanka Ọnụ ọgụgu ndị nwụrụ na mwakpo eji ogbuniwe mee n'ulọ ụka nakwa ụlọ ezumike eruola mmadụ nara abụo na iri itoolu, ebe ihe karịrị mmadụ nari ise merụrụ ahụ. Amabeghi onye kpara ike a, mana aka ndị nchekwa ji mmadu iri abuo na anọ a na-enyocha. N'egwuregwu Onye ọgba ọsọ Divine Oduduru tụrụ ugo na asọmpị ọsọ akpọrọ Michael Johnson Invitational agbara ụbọchị Satọde ụbọchi nke iri abuọ nke ọnwa Apreelu, 2019. Oduduru ji nkeji itoolu na ọma ji merie ma chabịe ọkacha gba Francis Obikwelu gbatara n'afọ 1999. Gee Nkeji ndi ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe ọnyonyo nke taa: Killiwee Nwachukwu" afirika-44904580,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44904580,Akụkọ ndị kachasị taa: Erighị nri abalị n'oge na-ebute ọrịa kansa,Erighi nri abalị n'oge na-ebute ọrịa,"I makwana na erighị nri abalị n'oge na-ebuite ọrịa ? Otu kpọrọ onwe ha Barcelona Institute for Global Health na bekee kwuru na nchọpụta ọhụrụ ha mere, na ọ na-ebute izi agede nke a kporọ 'prostrate cancer' maọbụ izi ara nke bụ 'breast cancer'. Ọbịara ije ma-ụna n'ala Rọshịa Naịjirịa na-atụ anya nlọta mmadụ otu narị iri atọ na-anọ tọrọ na Roshia ga-alaghachị azụ na Abuja taa. Ozi na-eru anyị bụ na abaala ụgbọelu na kwa na ha ga-efadata na Abuja na abalị a. Joe Igbokwe ga-aza ikpe di n'ishi ya Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa agbaala Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwụrụ APC na Legos akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na o boro gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu Facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe kachasị n'Abuja. Joe Igbokwe arịọla arịrịọ mana Adegboruwa gbadosiri ukwu ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere. Son ebiyeela aka n'akwụkwọ N'egwuregwu, ọgba bọọlụ Son Heung-min nke otu Tottenham ebinyeela aka n'akwụkwọ ọhụrụ nke otu ya ruo afọ 2023. Son Heung-min banyere otu Tottenham n'afọ 2015. Ugbua o nyeela goolu ruru iri anọ na asaa. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu" afirika-44183317,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44183317,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Massob achọghị ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ na Mee 22,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:,"Ndị bịara ntuliaka APC n'Enugwu Ọgụ na mgba aghasaala congress ndị APC mere n'Enugwu taa. Ndị uweojii ji egbe na gas anyammiri chụsaa ndị mmadụ ka ha bidoro ime ngagharị iwe n'ọgbakọ e mere iji họpụta ndị ọhụrụ ga-achị na APC. Ha bidoro mkpamkpa maka na ha sị na ha ahụghị aha ha n'akwụkwọ INEC ji. Ebe ọzọ na Naịjirịa Otu ọzọ na-achọ nwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra Ndị otu MASSOB ajụla na agaghị eme ""onye ọbụla nọrọ na be ya"" n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee a. Fred Onyenaucheya bụ onyeisi ndị MASSOB n'Abia saụt kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịpụta n'igwe bịa nwere aṅụrị kama ịnọ n'ụlọ . Na mba ofesi, Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ụfọdụ ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan Markle bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka. Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii. N'egwuregwu, A ga-ama mbe abụọ nke bụ oke n'etiti Chelsea na Manchester United Ndị otu Chelsea na Manchester United ebidola egwu anyị ga-ama onye ike ga-agwụ iji mata onye ga-ebuli iko FA nke afọ a. Onye ọbụla meriri n'etiti ha ga-ezute Manchester City ma afọ ọhụrụ bido, iji mara onye ga-ebuli ihe nrite akpọrọ community shield. Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya. Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume. Ara m bụ oke ibu arụ nye m" 46337004,https://www.bbc.com/igbo/46337004,Corpus Christi: Ka emume #Christtheking siri kpọtụọ n'Enugu,Oriri Kristi bụ Eze (Christ the King) bụ nke ndị ụka Katọlịkị na-eme otu ụka n'afọ iji were gosipụta na Jesọs Kraistị bụ Eze n'ezie.Oriri a bụ nke a na-eme na ụka ikpeazụ na kalenda nke ụka.,"Igwe mmadụ apụtala maka Oriri Kristi bụ Eze n'Enugwu Ihe nke a pụtara bụ na tata bụ ụka ikpeazụ tupu abanye oge Adventi. N'Enugwu ya bụ mmemme na-ekpo ọkụ site na parish dị iche iche ịkwụ n' ahịrị n' ahịrị na-ekpe ekpere, agba egwu, were na eto Kristi bụ eze. Ọtụtụ parishị dịka Holy Ghost Cathedral Enugwu, St Michael's Asata, Blessed Sacrament Parish, St Mulumba New Haven Enugwu na ọtụtụ ndị ọzọ pụtara n' igwe gagharịa n'okporoụzọ dịga n' Enugwu.Onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye ụka Katọliki na-egosiputa otu ọ nọ n'ụka tata site na isoro ndị otu ya na- agbara Kraistị egwu. Oriri Corpus Christi(Body of Christ/#Christtheking) gbadoro ụkwụ na akwụkwọ nsọ oge Jesọs sara pilate ajụjụ sị "" n' ezie a bụ m eze"" Mmemme Kristi bụ Eze gasia tata, ụka na- abịa, ụka ga-amalite Adventi iji kwadebe maka ọmụmụ onye nzọpụta Jeso Christi." afirika-44812264,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44812264,IPOB: Okwu Miyetti Allah bụ ịma aka mgba,Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob ekwuola na okwu Miyetti Allah bụ otu na-anọchite ndị ọchị-ehi kwuru bụ okwu ha chọrọ iji maja ma yie ndị Igbo na ndị ọzọ sị ọwụwa-anyanwụ bị n'ugwu-awụsa egwu.,"N'ozi nke odeakwụkwọ mgbasa ozi otu Ipob bụ Emma Powerful zitara BBC, Ipob kwuru na okwu ahụ bụ okwu dị ime ma marakwa ọgọdọ n'ihi ọ bụ mba ọgụ etinyere ọnụ n'ime akpa were na abaa. Ha kwuru na ha agaghị agba nkịtị ka o mezuo n'ihi na ha dị njikere ịwanye ndị ọbụla wakporo ndị sị ọwụwa anyanwụ na ọdọ-ahịa ha ji ọkụ n'aka. ""Anyị chọrọ ime ka odoo anya na iko ndị ọbụla mekatara wakpo ndị Igbo ọbụla maọbụ ahịa ha dị n'ugwu-awụsa ji manye ka anyị ga-eji manyere ha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: N'ọsịsa ha nyere n'ụbọchị Wenezde banyere mkpebi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na ha agaghị enye ha ala maka iwu ọdọ-ehi, otu Miyetti Allah kwuru na ọ tụrụ ha na anya na ndị gọvanọ nwere ụdị mkpebi ma kwuo na o kwesiri ka ha bụrụ ndị na-atọ ezi mkpụrụ dịka ndị Igbo bikwa na mpaghara ndị ọzọ na Naijiria. Ndị otu Ipob kwuru na mkpebi ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ iji gbochie ọgbaghara ma bụrụkwa ihe kwesiri na otu nọchitere ndị ugwu ( Arewa) na ndị chọrọ udo na Naijiria kwadoro." afirika-49389385,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49389385,Paris Waiter Murder: N'ihi ebuteghi nri n'oge ka mmadụ jiri gbuo mmadụ ibe ya,Onweghi ihe mmadụ agaghị anụzi ugbu a o.,"Akụkọ kachasị taa: Ndị uweojii nọ n'ihu ụlọ oriri ahụ ebe ya bụ ihe mere Otu nwoke agbagbuola onye na-enye aka n'ụlọ ebe a na-ere nri na France n'ihi na o buteghiri ya nri ya n'oge? Nke a mere na mpaghara Noisy-le-Grand nke dị nso n'obodo Paris, isi obodo France. Nwoke kpara arụ a riri mbọmbọ ọsọ mana ndị uweojii obodo Paris ekwuola na aka ga-akpara ya n'oge na-adịghị anya. Big Brother Naija Joe na Enkay efeela aka Agbaarala Joe na Enkay ụgbọnwamkpi n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ 2019. Joe, onye ezigbo aha ya bụ Joseph Abdallah, na Enkay, onye aha ya bụ Ede Nkechinyere, bụ ha nwetara vootu kacha nta n'egwuregwu ahụ n'izuuka gara aga. Ndị fọziri n'egwuregwu a ugbua bụ Tacha, Omashola, Ike, Cindy, Khafi, Elozonam, na Frodd. Nnyocha ọchịchị Obasanjo Otu a kpọrọ ""Socio-Economic Rights and Accountability Project"" maọbụ SERAP n'aha ịchafụ ekwuola na ha nabatara atụmatụ ndị EFCC wepụtara iji nyochaa ijeri dollar iri na isii bụ nke e kwuru na aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo tinyere n'ihe gbasara ọkụ latrik. SERAP kwuru na nke ahụ ga-egosi na n'eziokwu, iwu obodo Naijiria anaghị asọ mmadụ ọbụla anya. Mkaprịtaụka Obasanjo na BBC Oteela aka ebidoro kwube na Obasanjo mere nrụrụaka n'ihe gbasara ọkụ latrik oge ọ nọ n'ọchịchị. Mana onwebeghi mgbe a kpụpụrụ ya n'ụlọ ikpe maka ya. Ihe mere Ekweremadụ ga eme ndị ọsọ - Nnamdi Kanu Nnmadi Kanu na-akatọ gọọmenti etiti maka mmegbu okwuru na ana-emegbu ndị Igbo Onye ndu otu ndị Ipob bụ NnamdI Kanu akwadoola mwakpo ndị otu ya wakporo Ike Ekweremadu na mba Jamanị ma kwuo na otua ka ha ga-naeme ndị ọchịchị ala Igbo niile. Kanu kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ụtụ Sọnde. Mana Ekweremadụ n'onwe ya eweputala akụwkọ ozi na-ekwu na ya emerụghị ahụ ọbụla na mwakpo ahụ. O kwukwara na ya agbaala mkpesa n'aka ndị uweojii mba Jamanị, nakwa n'aka onye nnọchite obodo Naijiria n'ebe ahụ. Ekweremadu gakwara n'ihu kwuo na ọ gbagharala ndị niile kpasoro ya agwa ọjọọ a n'ihi na ha amaghị ihe ha na-eme. Ashley Cole apịnyụọla ọkụ N'egwuregwu, ọgba bọọlụ mba England bụ Ashley Cole apịnyụọla ọkụ n'igba bọọlụ taa ma kwuo na ya ga-elebazi anya n'ihe gbasara nkụzi bọọlụ. Asley Cole onye gbara afọ iri atọ na asatọ tutere ọtụtụ ugo oge ọ nọ n'egwu nke gunyere, iko Champions League, Europa cup, Premier League nakwa FA cup. Cole gbakwaara ọtụtụ otu bọọlụ ama ama n'akụkụ ụwa nile dịka Arsenal, Chelsea, AS Roma (Italy), LA Galaxy (Amerịka) na Derby County. Akụkọ ndị-ọzọ ga-amasị gị: Food vendor: Ndị mba ọzọ na-abọ nri ma abọ karịa ndi Naịjirịa" afirika-44050329,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44050329,Igboezue: Taa gọọmentị ụta maka oke ogbugbu mmadụ,Otu Igboezue ndị nọ n'ụlọ na ndị nọ na mba ekwuola ka gọọmentị kwụsị ịtụ ndị irọ aka sị na ọ bụ ndị chọrọ ka agha daa na Najiria bụ ndị na-akụsu oke ogbugbu mmadụ na-eme na Naijiria ugbua.,"Nsogbu Fulani ọchịehi na ndị ọrụugbo atala isi mmadụ karịrị puku abụọ na otu afọ na ọkara gara aga Kama ha tara gọọmenti etiti ụta sị na ọ bụ ha ji aka rụta mmanụ tezuru ala Naịjirịa ahụ n'ihi na ha ejighị n'oge mee ihe banyere mkpamkpa ndị Fulani ọchịehi na-akpa nke ha kwuru mere ya bụ nsogbu a jiri kawanye njọ. Dịka ụlọọrụ akụkọ Vanguard kwuru, onyeisi Igboezue bụ Pius Okoye si, na ""Ọ bụrụ na e nwere onye ọbụla na-akwado agha na Naijiria, na ọ bụ ndị Fulani na-achị ehi na ndị otu Miyetti Allah ndị ji ọnụ ha kweta ma kwukwa ihe mere ha jiri gbuo mmadụ 73 na Benue steeti n'ọnwa Jenụwarị afọ a, mana ọnweghị onye n'ime ha anwụchiri."" Kama ime ihe maka ndị ọchịehi ogbummadụ, ọ sịrị na onyeisiala Buhari tugharịrị na-ebo ebubo na ogbugbu mmadụ a bụ ndị chọrọ ibute agha na Naijiria na-abọlite ya, ebe ọ gbaburu nkịtị kemgbe ha na-akpa ike, na-egeghị ntị n'oku ndị Naijiria na-akpọ ka a nwụchịe ndị isi Miyetti Allah. O kwuru na Buhari adụghị ndị ọchịehi ọdụ, ọzighaghị ndị agha ngwangwa maọbụ ga leta ndị ọdachị ndịa mere na Benue ozigbo ha mere. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47956610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47956610,Violin music: 'E ji m ngwa egwu a etipụta egwu Igbo ka omenaala anyị tọọ atọ',Kedụ ihe na-amasịkarị gị ime?,O nwekwara ike ịbụ ihe ị na-agụtaghị na Mahadum. Uchechukwu na ndị o ji ngwa egwu bekee akụziri egwu Igbo ga-akpalite mmụọ gị n'onyonyo a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-46686698,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46686698,Boxing Day: Ọ bụ ụbọchị e ji akụ ọkpọ?,"Mbido 'Boxing Day' edoghị anya, mana a na-ekwu na 'omenala' bidoro n'ụka oge gboo, oge ndị ụka ji igbe anatakọta ego e ji enyere ndị mmadụ aka.","Ngwugwu ndị mmadụ na-atụkọ a na-atọpe ya ụbọchị Disemba 26, ụbọchị ncheta onye nso Stephen bụ onye mbụ e gburu maka ikwenye na Kraist. Mana amara ndị mba Briten dịka ndị bidoro were ụbọchị Disemba 26 dịka ụbọchị ezumike. Ha na-enye ndị na-agbara ha odibo maọbụ ndị na-arụụ ha ọrụ ezumike ma nyekwa ha ihe onyinye. Omenala mechara gbasaa na mba ndị ọzọ dịka Canada, Australia. Na Naijiria ụfọdụ na-eche na emume a metụtara ịkụ ọkpọ Ebe ụfọdụ na-akọwa na Naijiria, na ndị mmadụ anaghị ahụ ya dịka ụbọchị inye onyinye ka ma ọ bụ ụbọchị ụfọdụ ji aṅụ mmanya,lụọ ọgụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44689977,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44689977,Ipob: Tọpụnụ Nnamdị Kanụ na-egbughị oge,"Otu Ipob akpọkuola ndị gọọmenti ka ha were ọsọ, were ije tọhapụ onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu n'agbụ e kere ya kemgbe ndị agha Naịjiria wakporo ụlọ ya n'Afaraukwụ, n'Abia steeti n'ọnwa oktoba 2017.","Ipob kwuru na ""eziokwu apụtala ife were gbaa kepụkepụ nịịle a na-anụ maka ebe Kanụ n'anwụ"". Ipob, na-akwụkwọ mgbasa ozi ha nke ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful zitere BBC kpọkuru ndị mba ụwa; United Nations, Britain, USA na ndị mba ọzọ mepere anya ka ha kpọkuo ndị Naịjirịa ka ha tọhapụ onyeisi ya ngwangwa. N'okwu ya "" onweghị iwu ndị na Naijiria, ECOWAS, AU maọbụ United Nations kwadoro ndị agha Naịjirịa ịkpara maọbụ ijide mmadụ ka ha si chọọ na-agbanyeghị iwụ obodo"". Ha sị na ""mmaja a na-amaja ndị napụtara Nnamdi na-akaebe bụ ndị gọọment were wezuga uche ndị mmadụ na ọ bụ ha bụ oke tara azụ"". Nwaamadị bụbu Mịnịsta mgbasa ozi na gọọmenti Goodluck Jonathan bụ Femi Fani kayode ekwuola na Nnamdị Kanu nọ n'ime ụgbọmmiri ndị agha Naịjirịa nke dị na ikpere mmiri Bayelsa. Kayode kwuru nke a n'akara twitter ya ebe okwuru na gọọmenti Buhari bu n'obi ịdowe ya ebe ahụ ruo mgbe emechara ntuliaka 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49437537,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49437537,COZA Pastor: Biodun Fatoyinbo azaghị oku anyị kpọrọ ya bịa kwuo ọnụ ya - PFN,"Otu jịkọrọ ndị ụka ọgbara ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ Pentecostal Fellowship of Nigeria, PFN, n'aha ịchafụ agbaala ama na ha enweghị ikpe ibi okwu banyere ebubo mwakpo n'ike e boro Pastọ Biodun Fatoyinbo.","Bishọp Emma Isong kwuru na Fatoyinbo azaghị oku niile a kpọrọ ya, ebe Busola Dakolo bịara kọọ ka o siri metụta ya Aha Biodun Fatoyinbo wuru ewu na Naijiria ọnwa ole na ole gara aga dịka Busola Dakolo, nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo boro ya ebubo na ọ wakporo ya oge ọ bụ nwata nwaagbogho ọtụtụ afọ gara aga. Onyeisi PFN hiweburu kọmitii iji lebanye anya iji mara ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ otu ọnwa gara aga. Mana dịka otu onye ndu komiti ahụ bụ Bishop Emma si kwuo na mkparịtaụka kọmitii ahụ na ndị ntaakụkọ nwere na Legọs ụbọchị tọzde, PFN enweghị ike ichịkọta ya bụ okwu. ""Anyị enweghị ike ịchịkọta okwu n'ikpe ahụ n'ihi na otu onye na ndị o metụtara bụ Pastọ Fatoyinbo azaghị oku niile a kpọrọ ya bịa kwuru ọnụ ya."" ""Mana anyị na-ekele Oriakụ Dakolo onye ya na di ya so bịara kwuo ihe mere ya n'olu arịrị."" Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-44769449,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44769449,Nritu Boris Johnson ebulitela okwu 'Brexit' elu,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Boris Johnson arituola n'ọkwa dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na ndị ọzọ nke Bekee kpọrọ 'foreign' Secretary'.,"Boris Johnson sobụ na ndị chọrọ ka Briten si Yurope pụọ Akụkọ kwuru na Johnson rituru ka e nwechara arụmụka gbasara atụmatụ mba Briten ga-esi mee 'Brexit'. Ọpụpụ Johnson mere ka ọ bụrụ onye na-arụ n'obi ọchịchị minista nke abụọ ga-aritu n'ọkwa n'ime awa 24, ka David Davis bụ odekwụkwọ Brexit rituru. Nritu ya na-abịa naanị nkeji 30 tupu Praịm Minista bụ Theresa May ekwuputa atụmatụ ọhụrụ o nwere gbasara Brexit na 'Parliament'. N'akwụkwọ ozi, gọọmentị kelere Johnson maka ọrụ ya, ma kwuo na a ga-ekwuputa onye ga-anọchi ya n'oge na-adịghị anya." afirika-52667189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52667189,Sleep: Uru ụra bara na ọnọdụ kacha mma ihi ụra,Igbo sị na-ụra tọwa ụtọ ekwowe ya ekwo.,"Ochiedike aka na-aghọnkọ n'edemede, onye mba Briten bụ Thomas Dekker sị na ụra bụ ụdọigwe (chain) nke jikọtara ahụ mmadụ na ahụike ya. Nke a gosiri uru ụra bara na ndụ mmadụ. Ụra so n'ihe dịkachasiri mkpa mmadụ niile na-eme mgbe dum. Onye anaghị arahụ ụra nwere nsogbu. Mmadụ na-etinye otu ọkara n'ụzọ atọ (One third) mgbe ya n'ụra kwa ụbọchị. Otu ahụ nrị na mmiri sị dịmkpa, otu ahụ ka ụra sịkwa dị mkpa. Ị rahụ ụra zuruoke dị oke mkpa karịchaa. Clara Inneze sị na onye anaghị ehi ụra nke ọma kwesiri ịga ụlọọgwụ maka enyemaka Clara Inneze bụ Klinikal Saịkọlọgist bụ ndị na-ahụ maka ahụike echiche mmadụ kwenyere na "" ụra bara uru hienne nke bụ na ọ na-eme ka ahụ dị mmadụ mma."" Mmụta sị na onye anaghị arahụ ezigbo ụra na ụbụrụ ya anaghị ezuoke maka ọ bụ ụra na-enye aka ka ụbụrụ mmadụ akpakọọ ọnụ, nwee ike na-echeta ihe mgbe akpara ya aka. Ụra na-enye aka ịme ka akwara ụbụrụisi nwee ike na-ezikọrịta onwe ha ozi dịka Clara si kwuo na ""ọ bụrụ na mmadụ arahụghị ụra nke ọma ọ gaghị echeli echiche bara uru"". Ọ na-enyekwa aka ịme ka ụmụaka too ka ha kwesiri. Ọ dị mkpa ka ị mata na ụbụrụisi mmadụ na ahụ ya nọ n'ọrụ mgbe onye ahụ na-ehi ụra. Nchọpụta ọhụrụ kwuru na ụra na-enye aka iwepu ụnyi nke ime ụbụrụ Bekee kpọrọ ""toxin"" bụ nke na-akpụkọ mgbe mmadụ mmuanya. Ụra na adị onye ọbụla ahụ mma, mana ọrụ ọ na-arụ n'ahu mmadụ dị omimi. Nchọpụta na-akọwa na ụra bara ụrụ nye ihe niile na-arụ ọrụ n'ahụ mmadụ site na ụbụrụ, obi, ngụ, nakwa akụrụngwa na nyere ime ahụ aka ebuso nje ọgụ Bekee kpọrọ ""immune system"". Nchọpụta a gosiri na e nweghị ụra zuruoke nwere ike ibutere mmadụ ọbara mgbalielu, ọrịa obi, ọrịa shụga, obi ọjọọ nakwa oke ibu. Ugbua, sayensi amalitela ịghọta ka ụra si e nyere ahụ mmadụ aka. Uru ụra bara na ndụ mmadụ •Ọ na-enye aka ịme ka uche mmadụ kpokoọnụ Akwụkwọ akụkọ intaneti bụ MedicalNewsToday na-akọwa na ọ nwere ọtụtụ nyocha ndị sayensi mere n'afọ 2000 gawa, bụ nke tinyere anya na-ọghọm dị n'echumụra. Ihe ha chọpụtara na nkenke bụ na ụra nwere ọtụtụ ihe ọ na-eme n'ụbụrụ mmadụ nke gụnyere •Uche izuoke •Ike ichepụta ihe ahụrụ anya •Na ịcheta ihe maọbụ ịmata ihe Nyocha ọzọ e mere n'afọ 2015 e tinyere n'akwụkwọ 'Journal of Child Psychology and Psychiaty' na-egosi na ka ụmụaka si arahụ ụra nwere ike imetuta agwa na ka ha sị eme n'ụlọakwụkwọ. Ibu oke ibu Nchọcha enwebeghị ike ịkọwa ka ọ nwere ihe jikọtara oke ibu na echumụra, agbanyeghị na-emeela ọtụtụ nnyocha na ya mana Clara sị na onye na-enweta ezumike nke ọma nwere ike ibu ibu. Adịkwa ama ama, nyocha e mere nsonso a bụ nke e tinyere n'akwụkwọ 'Sleep medicine' kọwara hoohaa na ọnweghị ihe jikọrọ ya bụ udele na baba. Ha kwuru na-echumụra nwere ike imetuta ka mmadụ si ebi ndụ, mana ọgaghị eme ka mmadụ buo ibu. Mana ha chọpụtara na ịrahụ ezigbo ụra nwere ike ịme ka mmadụ ghara iri oke nri nke nwere ike ibute oke ibu. Iji maa atụ, otu nyocha e tinyere na ""Proceedings of the National Academy of Sceince of the Unted States of America"" kọwara na otu mmadụ si ehi ụra nwere ike ịmetuta ka agụụ sị agụ ya. Ha chọpụtara na ọbụrụ na mmadụ arahụghị ụra ka o kwesiri, ọ na-emetuta ka onye ahụ si eri ihe. Ịgbasi ike Dịka ndị National Sleep Foundation nke mba Amerịka si dee, onye kwesiri ị na-arahụ ụra awa asaa ruo itoolu n'abalị. Ndị na-eme egwuregwu nwere ike ịrahuzu awa iri. Ha chọpụtara na ụra dị ha oke mkpa dịka ezigbo nri sị dị ha maka ọ na-eme ka ha gbasie ike. Ọrịa obi Ihe na-ebutakarị ọrịa obi bụ ọbara mgbalielu. Dịka ndị Centre of Disease Control si kwuo, ịrahụ ụra zuru oke na-eme ka ọbara mmadụ nwee ike ịhazi onwe ya ma gbochikwa ọrịa ndị ọzọ n'ahụ mmadụ. Ahu mgbaka Onye enweteghị ụra zuru oke na-enwekarịa ahụ mgbaka. Dịka akwụkwọ akụkọ MeidcalNewsToday si kọwaa, "" ọnwere ihe jikọtara ụra na ka ndị mmadụ sị akpaso ibe ha agwa"". Onye anaghị arahụ ụra zuruoke na-atakasikarị ndị mmadụ. Nchọpụta a dị n'akwụkwọ ""Journal of sleep Research"". Obi ọjọọ N'otu aka ahụ, nchọpụta na-aga n'ihu ịmata ka ọ nwere ihe jikọtara ọdịmma echiche na ụbụrụisi na ụra. Otu ihe doro anya bụ na a hụru na ọ nwere ịhe gbasara ụra na obi ọjọo. Nchọcha a ebipụta na JAMA Psychiatry na-enyocha ndị gburu onwe ha kemgbe afọ iri were hụ na enweghị ụra zuru oke so na ihe butere ha ọnọdụ ịwere ndụ ha. Nyocha ọzọ dị na Australian and New Zealand Jourrnal of Pychiatry sị na enweghị ụra zuru oke na-ebutakarị obi ọjọ. ""Ndị agha ime ahụ (immune system) gị ga-agbasi ike. Ụra na-eme ka ịmeahụ gbasie ike, gwọọ ma dozie onwe ya."", dịka ha dere. Nchọpụta egosila ka ụra si enyere ịmeahụ aka ịbuso nje agha. Gịnị nwere ike ichu mmadụ ụra? Clara Inneze sị na ihe ndị a nwere ike ibutere mmadụ echumụra. •Nsogbu ụwa nwere ike ịgba mmadụ echumụra. •Ọnọdụ echewe echeteghị nwekwara ike ịgba mmadụ echumura. •Ọria nwekwara ike ịgba mmadụ echumụra •Obi ọjọọ were ike ịme mmadụ ụra aga n'anya. •Ọnọdụ ahụike ụbụrụisi Gịni bụ ụra zuruoke? Kedụ mgbe ụra ji ezuoke n'ahụ mmadụ? Lee ka ndị ọkachamara si zaa ajụjụ a. •Nwa a mụrụ ọhụru (0 - 3) awa 14 - 17 •Obere nwa (ọnwa 4 - 12) awa 12 - 16 •Nwa na-egbe igbe (afọ 1 - 2) awa 11 -14 •Nwa ọtaakara (afọ 3 - 5) awa 10 - 13 •Nwa akwụkwọ praịmarị (afọ 6 - 12) awa 9 - 12 •Ntorobịa (afọ 13 - 18) awa 8 - 10 •Okorobia (afọ 18 - 60) awa 7 •Okenye (afọ 61 - 64) awa 7 - 9) •Agadi (afọ 65+) awa 7 8 Ihe na-egosi na mmadụ gbara echumụra •Ịtete n'ime abalị •Ụra ịtụ mmadụ mgbe onye ahụ kwesiri ịmụ anya Lekwa ihe ị ga-eme ka ị nwee ike ịrahụ ezigbo ụra Kedụ ọnọdụ ụra ka gị mma? Kedụ ka ị sị anọ mgbe ị na-arahụ ụra? Ị na-amado afọ n'akwa, ka ị na-egbu nkọ, ka ọ bụ egbuaba, ya bụ ịche ihu n'elu, Ka ị na-atụgharị atụgharị kwa mgbe? Mmụta na-ekwu na ọnọdụ ụra gị nwere ike ịnye aka n'ụdị ụra ị ga-enweta. Ajọ ọnọdụ nwekwara ike ibutere gị azụ mgbu maọbụ olu mgbu. O nwekwara ike ịgbachi gi akpịrị me ka ị ghara ikute ume ọfụma butere onye ahụ ọnọdụ Bekee kpọrọ ""obstructive sleep apnea"". Ụfọdụ ndị okpokpo akwụkwọ na-asịkwa na ọ nwere ike ịme ka ụnyi ịme ahụ Bekee kpọrọ ""toxins' ghara ịna apụ n'ụbụru ngwa ngwa. Leekwa ọnọdụ dị iche iche e sị ehi ụra na ihe ọ pụtara Ịmado afọ n'akwa Nchọpụta gosiri na ihe dị ka pasenti mmadụ asaa n'ụwa na-amado afọ n'akwa arahụ ụra. Mgbe ụfọdụ Bekee na-akpọ ya ""prone position"". Ọnọdụ a nwere ike ịbelata ịkwo ụra mana ọ nwekwara ọghọm so ya. O nwere ike ibutere onye ahụ azụ mgbu maọbụ olu mgbu maka na ọkpụkpụ olu na nke azụ anozigbi nke ọma. Ha sikwa na o nwere ike ibute mgbanwụ akwara nke ga-eme na ọbara agaghị na-ekwo nke ọma. Ọ bụrụ na ọnọdụ a ekweghị gị nhapụ, tinye pilo n'isi gi ka ọ mee ka isi gị na olu gị nọrọ ọfụma. Egbuaba maọbụ Igbuaba ""Free Fall Position"" Ọnọdụ a bụ ịgha aba maọbụ ichewe ihu n'elu mgbe ị dịna n'akwa ma chewe ihu n'akụkụ. Mụta gosikwara na ihe ruru pasenti mmadụ asaa n'ụwa na-ehi otu ahụ. Ha sịkwa na ndị na-ehi otu a na-ekukwa pilo mgbe ụfọdụ. Ha chọputara na ndị na ehi otu a nwere ike inwe ukwu mgbu maọbụ mee mgbu nke ịweburu ọ ka njọ. Ọ bụrụ na ị na-ekwo ụra, ọnọdụ a nwere ike ị me ka ọ ka njọ. Umụnwaanyị dị ime afọ ha kawagoro kwesiri ịgbara ọnọdụ a ọsọ. Ọnọdụ a dịkwa mma maka na-ọkpụkpụ ọlụ gị na nke azụ gbatiri agbati mgbe ị nọ na ya. Nke a pụtara na ị gaghị enwe olu mgbu. Itinye obere pilo n'isi gị mgbe ị ghara aba ka ha sị na ọ bụ ọnọdụ ụra kachasị mma, ọkacha maka ndị na-enwe achaobi Bekee kpọrọ ""heartburn'. Ịdịna teteretee ""Soldier Position"" Onye dịna n'ọnọdụ a ghara aba ma dowe aka ya abụọ n'akụkụ ahụ ya. Ndị na-ekpe ekpere ime mmụọ Bekee kpọrọ ""meditation"" na-anọkarị n'ọnọdụ a. Nchọcha sị na ọnọdụ a na-ebuta ikwo ura nke ukwuu. Ha sịkwa gị kpoturu dọkịnta gị maọbụrụ na ịkwọ ụra anaghị ekwe gị arahụ ụra nke ọma. Ọnọdụ nghasa ọkpa ""starfish position"" Onye dịna n'ọnọdụ a chere ihu n'elu maọbụ n'akwa ma chilie aka ya elu. Ndị na-adịla na ọnọdụ a na-ekwo karị ụra. Ha nwekwara ike inwe ahụ mgbu dị iche iche. Igbunkọ Ọnọdụ a ka ndị mmadụ kacha anọ. Ọ bụrụ na ị na-ekwo ụra, ọnọdụ a nwere ike ị kara gị mma. Mana ọ dịchaghịrị onye nwere ""arthritis"" mma. Mana sayensi chọpụtara na ịgbunkọ nwere ike ịnye aka ka unyi ime ahụ wee ike ịpụ n'ụbụrụ ngwa ngwa mgbe anyị na-ehi ụra. Mana nchọpụta a ka na-aga n'ihu. Ọ bụ eziokwu na ọnọdụ a dịka ọ ka ibe ya mma mana nchọcha gosiri na ọ na-ewepụta akaranka Bekee kpọrọ ""wringles"" n'ihu ma onye ahụ kawa. Ụfọdụ na-echekwa na ọ na-ebute ara nwaanyi ịda maka na ọ na-eme ka nke Bekee kpọrọ Coopers Ligament"" dọtia. Ọ nwebeghị nchọpụta gosiri nke a mana ọ bụrụ na egwu ya na-atụ gị, were pilo hido ara gị mgbe ị nọ n'ọnọdụ a. Ndị na-enwe obi mgbu kwesiri ịhapụ ọnọdụ a maka ịdịna n'azụ maọbụ idịna n'aka ekpe nwere ike ime ka ụda obi onye ahụ na-akpọte ya n'ụra. Ị dịna n'aka nri nwere ike ịkara ndị ahụ mma. Ịgba nkụrụnkụ ""Fetal Position"" Nke a bụ ọnọdụ ịgbakụ agbakụ mgbe ị gburu nkọ. Ụfọdụ na-ekwu na ụmụnwaanyị ka adịna n'ọnọdụ a karịa ụmụnwoke, mana nchọpụta egosibeghị ya. Mana ha chọpụtara na ọnọdụ a dị mma maka ụmụnwaanyị dị ime maka na ọ na-eme ka ọbara sị na nne na-ekwoga na nwa ga-aga werewere. Ọ bụrụ na ọnọdụ a na-enye gị nsogbu n'ukwu, itinye pilo n'etiti ikpere gi abụọ nwere ike inyere gi aka. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51717049,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51717049,Imo Supreme Court Review: Ụlọikpe kachasị achụọla Ihedioha,Ngalaba nyocha n'Ụlọikpe Kachasị nke Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa bụ Tanko Muhammed nọ n'isi ya ekwuola họ ha na mkpebi ha maka ndọrọndọrọ onye ga-abụ gọvanọ Imo steeti bụ...,"Cheta na Emeka Ihedioha na pati ya bụ Peoples Democratic Party (PDP) gakwuru ụlọikpe ahụ si ka eleba anya na mkpebi ha wepuru Ihedioha na ọchịchi Imo steeti. Ụlọikpe ahụ Arịrịọ PDP na Ihedioha, dịka ọkaiwu ha bụ Kanu Agabi si kwuo bụ na nrụrụaka dị na mkpebi ụlọikpe makana Hope Uzodinma sị na ya meriri na ọgige ntuliaka 388 wetera sọsọ akaebe si ogige ntuliaka 366. Ọkaiwu Agabi sịkwa na agbakọnye vootu si ogige vootu 388 ahụ ọnuọgụgu vootu ndị tozuru ịtu vootu na ntuliaka ahụ kwesiri ịtụ. Mana ọkaiwu Hope Uzodinma sị na arịrịọ Ihedioha na PDP ekwesighi ịbịa ụlọikpe makana mkpebi ụlọikpe kachasị bụ ejacha agwu." afirika-56848279,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56848279,Nigeria's inflation 2021: Etu 'inflation' si akpa mụ na gị eze,"Na nsonso a, ngalaba ngụkọ Naijiria bụ National Bureau of Statistics(NBS) wepụtara ozi nchọpụta ha mere nke kwuru na ọnụahịa(inflation) e jirila pasent iri na asatọ na ụma(18.17%) rịa elu.","Nke a bụ mgbali kachasị kemgbe afọ anọ gara aga. Dịka nchọpụta NBS mere siri kwuo, ihe ndị kachasị tinye ego bụ ngwanri(23%) ọkachasị, anụ,azụ, ji,nduku,bredị,mmanụ akwụkwọnri na mkpụrụosisi. Ọkachamara n'okwu nchọpụta metụtara iji ego achụego jiri osikapa kọwaa ihe ọ pụtara inwe 'inflation' site na ịgbakọ ihe ọ na-eri isi osikapa jelọf ga-ezuru otu ezinaụlọ mmadụ anọ n'afọ 2021 nakwa ihe o riri ime nke a n'afọ anọ gara aga. Ha kwụkwara ihe e nwere ike ime iji gboo ya bụ ọgụ mgbalielu ọnụahịa. Lee ya n'uju n'elu: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-54478743,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54478743,Flora Nwapa: Nwaanyị ike zara Ogbuefi na ndụ ya,E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Flora Nwanzuruahu Nkiru Nwakuche Nwapa? Ọ dị egwu!,"Nwapa tinyere uchu n'ịrụgharị ala Igbo mgbe a lụchara agha Biafra Nwapa bụ ""a takata a gbọo"" n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ. Tupu ndị mmadụ etibe mkpu maka ịbụ ""feminist"" n'ọgbaraọhụrụ a, Nwapa akpawala ike n'ụzọ nke ya iji gosi na ọ bụ ihe ọ bụ. Ọtụtụ akụkọ o dere bụ maka ihe nwaanyị na-agabiga ma n'ala Igbo ma na Naịjirịa. Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Ogbuefi Nwapa" afirika-51712793,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51712793,Super Tuesday: Kedu onye 'Democrat' ga-etozu ịma Donald Trump aka?,Ịchụ nta vootu maka iso zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka akpụrụla ọkụ n'ọnụ.,"Ndị Pati 'Democrat' na-achọ onye otu ha ga-ama Donald Trump aka. Taa bụ 'Super Tuesday' ka ha ga-eme ntuliaka imeụlọ na steeti 14. Onye ọbụla meriri ntuliaka a ga-agate aka na ndọrọndọrọ inweta akwụkwọ. Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ Bernie Sanders nwere ike ituru ugo. Mana Joe Bide, nakwa Michael Bloomberg nwere ike imekwa ọfụma. Onye ka ọ ga -abụ ya na Trump? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56514777,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56514777,Ihe anyị na-eme maka mkpa mkpa ndị otu nzuzo n'Ọkija - Uweojii Anambra,"Dịka mkpa mkpa dị otu nzuzo na abwanye na steeti ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bu Tochukwu Ikenganyia ekwuola etu na etu jiri chọọ isi buso ndị otu nzuzo na-akpa mkp amkpa na steeti gụnyere ime ka ndị ntoroọbịa hụta n'uru adịghị n'ajọ ihe dịka ihe a Bekee kpọrọ ""cultism"".","Ikenganyia sị na ha na ndị Okija enwela nkwekọrịta ịbịa malite ntụgharị uche ndị ntoroọbịa site n'atụmatụ ha hibere maka ya. Atụmatụ a bụ nke Bekee kpọrọ ""Police Campaign Against Cultism and Other Vices"" bụ nke ndị uweojii na-ele anya na o nwereike nyere ha aka gbanye obi ndị ntoroọbị. Content is not available End of Facebook post, 1 Cheta na ndị uweojii Anambra steeti na ndị agha Naịjrịa tikọrọ aka wakpo mpio ndị otu nzuzo dị na Okija dị n'Okpuruọchịchị Ihiala, Anambar steeti n'abalị Tuzde. Ha jidere ndị otu a mmadụ asatọ ma natakwa ha ihe akaebe dị ka egbe anọ, mgbo, nma abụọ. okpu ndị agha, anwụrụike na ihe ndị ọzọ. Ha nwuchikwara mmadụ atọ ha che so gbupu otu nwaokorobịa isi na Okija n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Maach. Cheta na ndị otu a gburu mmadụ abụọ n'obodo ahụ ụbọchị ahụ. Ndị a ejidere bụ Ekene Ezeokalo, (19) onye ụkpọ Ukpor Nnewi, Emeka Iwuozor (30), onye Umuduru Ezia Ihiala na Chigozie Ohanaziem (27) onye Ogboro Umunwaji Ihiala. Dịka ndị uweojii kwuru, mmadụ atọ a ekwetala na ha mere ya bụ arụ. Ọgbaghara na-ada aghara aghara n'Anambara ugbua. Ndị eche na ha bụ ndị otu nzuzo waporo ma napụ ndị nche egbe ha n'Obosi Chetakwa na ọgbaaghara dara na Obosi mgbe ndị nche so n'otu Anambra steeti Vigilantee group gara ịnata ụtụ nche n'Obosi ụbọchị bụ Mọnde ubọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maach. Onye huru ebe ya bụ ihe mere na-achọghị ka aha ya pụta sị na ""otu onye na-ere ihe n'akụkụ ụzọ ebe ahụ jụrụ ịkwụ ụgwọ nche"". Nke a mere ndị nche jiri buru oche o ji ere ihe ka ha gaa dowe n'ụlọọrụ ha. ""Ya bụ nwaamadị malitere zọsawa ha egbe ha bido tikuwe ndị otu ha"", dịka o kwuru. Okwu a malitere iri elu nke mere na ka chi ụnyaahụ foro, ndị otu a gara kụkachaa ụlọ ndị nche buru egbe ha laa. Ndị nche sị na ọ bụ egbe isee ka ndị ahuuru mana ndị otu ahụ mechere buru egbe abụọ ga dowe n'ụlọọrụ ndị uweojii nọ n'Obosi. Onye uweojii anyị kpọrọ sị na akụkọ a mere n'ezie mana na-ọbụghị ọrụ ya ịgwa ọhaneze ihe mere. Kama ọ sị na ha ka na-enyocha ya bụ ihe. Akụkọ ndị ọzọ anyị nụrụ na-ekwu na e jidere mmadị ise ndị otu a mana ndị uweojii ekweghị ekwu maka nke a ugbua. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ekwubeghị ihe ọbụla maka nke a. Ọnweghị onye e gburu na ya bụ ihe. Nnolim Nnaji: 'Ịchị ehi na-agharaị n'ụzọ anaghịzị ewu' Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47622779,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47622779,Governorship election: Anyị akwụchaala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu,Gọvanọ Okezie Ikpeazụ kwuru na ntuliakia gọvanọ e mere n'Abia Steeti bụ nke kachasị nwee udo na Naịjirịa gbaa gburugburu.,"Na Mkaprịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Okezie kwuru na ndị na-asị na o mere nrụrụaka na ntuliaka bụ ndị na-amaghị ihe ha na-eme. O kwuru na ebe ndị a na-akpọ aha bụ ebe ndị o nwere mmeri kama ha akpọghị ebe ndị ha meriri dịka ebe e mere nrụrụaka. Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị ya ejighi ndị ọrụ ụgwọ kama na ọ bụ ụfọdụ ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Sekọndịrị mana na ọ ga-akwụchapụ ha ụgwọ. Okezie kwukwara na ụgwọ ndị lara ezumike nka bụ ibu o butere n'aka ndị chịburu Abia Steeti na mbụ kama na o ji nwayọ na-akwụcha ụgwọ ndị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43722099,https://www.bbc.com/igbo/43722099,Naịjiria eruola 200m n'ọnụọgụgụ,"Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ ndị mmadụ na Naijiria bụ Eze Duruiheoma, ekwuola na ala anyị fọrọ nde abụọ ka o ruola nde nari abụọ (200m) n'ọnụọgụgụ.","Naijiria dịbụ nde 140 n'afọ 2006 E wepụtara ọnụọgụgụ ọhụrụ na New York ụbọchụ Tuuesde na ọgbakọ gbasara ọnụọgụgụ na mmepe mba ụwa agba nke iri ise. Duruiheoma kwuru na a na-ele anya na Naijiria ga-abụ mba nke atọ kacha n'ọnụọgụgụ na mba ụwa n'afọ iri atọ na-abịa. N'ọnwa gara aga, onye nnọchite anya mba Briten na Naijiria bụ Paul Arkwright, kwupụtara atụmuche na a ga -enwere 'nnukwu nsogbu oke ọnụgụgụ' ọkachasị dịka e nwere ọtụtụ ndị ntorobịa e nweghị ọrụ na ndị agụghị akwụkwọ , ebe ọtụtụ enweghị ohere nlekọta ahụike. N' ngukọ ọnụọgụgụ Naijira nwere n'afọ 2006, e kwuru na Naijiria nwere ọnụọgụgụ mmadụ nde otu nari na iri anọ(140m). Ka ihe dịka afọ iri gachara, ọbụzị mba nke asaa kachasị n'ụwa, nke pụtara na mmadụ iri anọ na atọ ọbụla n'ụwa bụ onye Naijiria. Akụkọ ga-amasị gị:" 44027503,https://www.bbc.com/igbo/44027503,Akụkọ kachasị taa: 'Ọkaikpe na-ekpe IPOB kwunyere Gọọmentị',Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Rochas na-arịọ Buhari Aka na-achi Imo steeti bụ Rochas Okorocha ji ọsọ gaa Daura be onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị. Ọ gara ịrịọ onyeisiala ka ọ kagbuo nhọpụta otu pati APC Imo steeti mere ụbọchị Satọdee maka na ọ dara ada. Otu IEI Otu a kpọrọ Igbo Ekunie Initiative ekwupụla iwe ha etu onye ọkaikpe Binta Nyako si ekpe ikpe ndị IPOB na Nnamdi Kanu na ezinaụlọ ya. Ha kwuru na iwe ha bụ na Binta nwere ebe ọ kwunyere dịka ha boro ya na ọ bụ ebumnuche ndị gọọmenti ka ọ na-eme. Na mba ofesi, aga-edu Putin'iyi ọrụ taa Vladimir Putin achịala mba Rọshịa n'ọkwa Praịm mịnịsta nakwa onyeisiala A ga-edu onyeisiala mba Rọshịọ bụ Vladamir Putin iyi ọrụ taa maka ọchịchị ya nke ugbo anọ dịka onyeisiala mba ahụ. Mmeri o meriri na ntuliaka ha ga-eme ya afọ iri na asatọ ọ bụrụla onyeisiala mana ndị na-anọghị n'ọchịchị sị na ọ bụ onye aka ike N'egwuregwu Otu onye egwu bọọlụ Super eagles bụ Leon Balogun ekwuola ka ndị ha nọrọ n'ahụ isi ike maka asọmpi iko mbaụwa na-abịa. Asọmpi ahụ na-ebido n'ọnwa na-abịa bụ Juunu na Rọshịa. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha. Asambodo gị o na-enye gị nri ? Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48203759,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48203759,Liverpool Vs Barcelona: Ihe tụrụ n'anya ndị mmadụ mara aka mere,Akụkọ ihe mere dịka Liverpool nyụrụ Barcelona ịkpakwụ n'abalị Tuzde agwụbeghi dịka ndị mmadụ ndị mara aka maka mpụtara asompi ahụ mere n'Anfield na-emezu ihe e riri ha.,"Kcee sị na ọbụghị onye Barca Otiegwu Kcee tụnyere otu nde naịra n'aka ya na otu onye na-akwado Liverpool a kpọrọ Chidozie mara banyere onye ga-emeri n'asọmpi ahụ. Tupu a gbaa bọọlụ ahụ nke Liverpool jiri ọkpụ anọ kụọ Barcelona ekwe, Kcee turu ọnụ na Barca ga-akụ Liverpool isi aba okpu mana ọ bụghị ihe ọ tụrụ anya ka ọ hụrụ. End of Twitter post, 1 Chidozie mechara gbaa akaebe na ozi e ziri anwụrụ ọkụ eruola eluigwe ntị dịka ọ natara ozi n'ekwentị ya na Kcee akwụnyela ya otu nde naịra ahụ ha mara aka ya. N'aka nke ọzọ, Charles Anazodo bụ onye ntaakụkọ egwuregwu a ma ama, tuburu ọnụ na ọ bụrụ na Liverpool merie Barcelona na ọ ga-eyi ọbante gaa ọrụ. O mezukwara nkwa ahụ dịka ọ sụrụ ọbante nke Bekee kpọrọ 'boxer' gaa ọrụ taa bụ Wenezde. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44869247,https://www.bbc.com/igbo/44869247,Oke mmanya: Etu FRSC ji chọọ iji 'breathalyzer' kwụsị mberede okporoụzọ,"Adeyemi Obagbemiro bụ osote onyeisi n'ụlọọrụ na-ahazi nchekwa njem okporoụzọ a kpọrọ FRSC n'aha ịchafụ, gwara BBC na iwebata 'breathalyzer' abụghị isi okwu, maka na aka ga-ahụ na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ ezughị ezu.","Ọtụtụ mbere okoro ụzọ na-eme maka ndị na-akpọ ụgbọala ṅụrụ oke mmanya Obagbemiro kwuru na ndị na-arụ ọrụ FRSC dị ihe ruru naanị nchịkọta puku 30 agaghị agazu ndị Naịjirịa niile ruru mmadụ nde 180, nke bụ na 'breathalyzer' ndị agaghị arụnwu ụdịrị ọrụ a chọrọ ka ha rụọ. O kwukwara na ha nwere ndị nkịtị ha na-ejibu arụ ọrụ, nakwa nke elektrọnik mkpụrụ ole na ole ha na-eji tupu e bido ikwu okwu ịzụta ndị ọhụrụ. Gịnị bụ 'breathalyzer'? 'Breathalyzer' bụ ihe a na-eji enyocha ikuku ọnụ mmadụ ma a chọrọ inyocha ma ọ ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ma marakwa etu mmanya ahụ ha n'ime ọbara ya. Ndị uweojii na ndị ọrụ okporoụzọ nke bekee kpọrọ 'traffic police' maọbụ ụdịrị ndị FRSC na-eji ya enyocha onye ọbụla ha na-eche na-anya ụgbọala ka onye mmanya na-egbu. Ihe FRSC ga-eme onye e jidere maka ịṅụ mmanya na-akwọ ụgbọala Obagbemiro kwuru na ọ bụrụ na 'breathalyzer' enyochapụta na ị ṅụrụ mmanya na-akwọ ụgbọala, ha ga-eme ihe ndị a: 'Breathalyzer' nke aka nkịtị Uru dị na 'breathalyzer' 1. Nke elektọnik, ihe ị tinyere bụ ihe ga-apụta. Obagbemiro kwuru na a bịa na nke elektrọnik, onye ṅụrụ oke mmanya kuba ikuku si n'akpaume ya n'ime 'breathalyzer', ihe ọ ga-ewepụta bụ ogo mmanya na-aba n'anya dị n'ahụ gị rugooro kpọmkwem. 2. Ọ ga-eme ka ndị mmadụ kpachara anya 'Breathalyzer' nke elektrọnik Obagbemiro kwuru na ndị ọkwọ ụgbọala mata na ha nwere ike ịbanye nsogbu ma 'breathalyzer' gbaa ha ama, ha ga-eme ihe abụọ; Otu bụ ịhapụ ịṅụ mmanya tupu ha abanye ịkwọ ụgbọala, abụọ bụ ịnụ naanị ọbere mmanya ọpekata mpe otu awa tupu ha abanye ịkwọ ụgbọala. Ụzọ abụọ a ga-eme ka ihe mberede okporoụzọ belata. Ọghọm dị na 'breathalyzer' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46152047,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46152047,Aha Uche Nwosu na Hope Uzodinma adịghị n'ime aha Inec wepụtara n'Imo,Ọnụ na-ekwuru APC n'Imo bụ FCC Jones Onwuasoanya ekwuola na ọ bụ eziokwu na ha Uche Nwosu na Hope Uzodimma adịghị n'akwụkwọ bu aha ndị ga-azọ oche dịka gọvanọ Imo steeti n'afọ 2019 nke Inec tapesara n'ụlọọrụ ha n'Owere taa.,"Amabeghí ka APC Imo o ga-agba aka. Uche Nwosu na Hope Uzodimma so n'ime ndị zọrọ ị bụ onye ga-ejide ọkọrọtọ APC na ntuliaka nke 2019. Ha abụọ na-esi ọnwụ na ọ bụ ha meriri ntuliaka ahu, nke mere eji wepu okwu ahụ n'ụlọikpe. Maazi Jones Onwuasoanya sị na ọ bụ maka mkpebi otu n'ime ụlọikpe ji okwu a mere maka ya mere Inec ghara eweputa ha onye ọbụla. Ọ sị na Inec kwanyere ụlọikpe uwgu ruru ha. Jones Onwuasoanya sịkwa na ya che na APC nke Imo nwere onye ga-ejidere ha ọkọrọtọ. Ọ sị onye ahụ bụ Uche Nwosu. Aha ndị a etinyere n'ụlọọrụ Inec n'Imo bụ imezu nkwa Inec kwere na ha ga-ewepụ aha ndị niile ga-eso zọ ọchịchị na 2019 taa. Ndi aha ha di n'ime akwụkwọ a gunyere Emeka Ihedioha nke Peoples Democratic Party (PDP), Ifeanyi Ararume nke All Progressives Grand Alliance (APGA), Michael Ikoku nke Young Democratic Party na mmadụ iri isii na anọ ọzọ. BBC Igbo gbara mgbọ ịnweta Uche Nwosu na Hope Uzodinma ka ha tinye ọnụ n'okwu a. Ekwentị Hope Uzodinma dara ụda mana ọzaghi. Anyị enwetaghi Uche Nwosu. Akụkọ ndị ga-amasị:" egwuregwu-44675353,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44675353,Nwaanyị nọ na 'Mortuary' tetere ka a chọrọ ili ya,Ndị dọkịnta bekee ekpebiela na nke ya agaala.,"Onye eche na ọnwụru na SA Ndị ọrụ gbata gbata ambụlansi si na nke ya agaala na ""ndụ afọghịzị n'ime ya"". Mana mgbe onye na-elekọta ozu bịara lee anya n'ụlọ ntụoyi ọzụ, ọhụrụ na ya bụ nwaanyị ka na-ekuume. Gerrit Bradnick bụ onyeisi otu gbatagbata sị na ya bụ nwaanyi so na ndị nwere ihe mberede okporoụzọ nke tara isi mmadụ abụọ na June 24 afọ a. Nwaanyị a amabeghị aha ya nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ, dịka ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ gbaara BBC ama. Ihe a nke mere na mba Saụt Afrika bụ na Gauteng province ka ọmere. Dika ndị ọrụ gbanụgbanụ ụlọọgwụ ahụ na-eme nyocha gbasara ihe, Bradnick sị na ya echeghị na ya bụ ọgbataụghị sị ha n'aka ya. Akụkọ BBC kwuru na nke a abụghị mbụ na afọ a onye nwụrụ anwụ kuliri na ụlọ ọbaozu bekee kpọrọ ""mortuary"". Mapụ Saụt Afrika na-egosi ebe ihe a mere Afọ asaa gara aga, na otu Saụt Afrika ahụ, otu nwoke gbara afọ iri na ise tetere n'ọnwụ tiwe mkpu n'ụlọ ọbaozu nke ndị na East Cape. N'otu aka ahụ n'afọ 2016, otu nwoke eche na onwuru n'ihe mberede okporoụzọ mere na KwaZulu Natal, ka chi foro, ahụ na ọ ka dị ndụ. Nwoke ahụ mechara nwụọ ihe dịka elekere ise okulichara. N'ebe ọzọ, n'ọnwa mbụ nke afọ a, nwoke nọ mkpọrọ na mba Spen nke ekpebiri na ọnwụọala kuliri mgbe achọrọ ịbọwa ya afọ mata ihe gburu ya. Ndị dọkịnta bekee atọ ekpebiela na ya bụ nwoke anwụọla pii. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 48063346,https://www.bbc.com/igbo/48063346,Catholic Church: Ụmụnne Fada Clement Ugwu ji anyammiri bụọ ndi gburu ya ọnụ,"O meela otu ọnwa achọtara ozu Fada Clement Ugwu ebe ndị ntọ gburu ya tufue ozu ya n'ime ọhịa n'Enugwu, mana ibe akwa na iru uju ka juputara n'obi ụmụnne ya.BBC gara n'Ibite Uwenu,Awhum dị n'Enugwu steeti bụ obodo Fada Clementi Ugwu.","Maazi Patrick Egbujie Ugwu bụ diọkpara ezi-na-ụlọ ndị be Ugwu n'Awhum kwara akwa nke ukwuu oge ọ na-echeta ka ndị ntọrị siri gbuo nwanne ya nwoke Fada Clement Ugwu, onye bụ ọdụdụ nwa n'etiti ụmụaka iri nne na nna ha mụrụ. Mazi Egbujie Ugwu ji anya mmiri kwuo na ndị niile kpara nkata gbuo nwanne ya Clement abụrụla ndị abụrụ ọnụ.Nwanne Nna Clement bụ mazi Leonard Ugwu kwuru na ogbugbu ndị omekaome gburu Fada Clement Ugwu bụ ihe mgbawa obi kacha wee wute ezi-na-ụlọ a , were kwue na ha chọrọ ihụ isi ihe mere ndị gburu Clement jiri kpaa arụ ahụ. Maazi Patrick Egbujie Ugwu bụ diọkpara ezinaụlọ ndị be Ugwu n'Awhum, Enugwu steeti Ndị Awhum ka nọ n' iru uju maka ọnwụ Clement Ugwu, nke na ọtụtụ mmadụ ka na-abịa n'ụlọ ha maka ọnọdụ omenala iru uju.Fada Clement Ugwu bụ onye amụrụ na Ibite Uwenu n'Awhum, Enugwu Steeti, ebe ọ bụ nwa nke iri nna ya bụ Catechist mụtara.Ochiri ụkọchukwu katọliki na afọ 2010. Fada Clement onye ndị mmadụ na etu""Rapụlụchukwu okwu"" zutere ọnwụ ya na parish ya bụ St. Marks Obunofia dị n'Ezeagu, oge ndị ntọrị tọrọ ya ma gbagbue ya.Ahụzrị ozu Fada Clement Ugwu n'ime ọhịa ebe orerichara ka out izu uka gachara. Bishop Callistus Onaga nke Enugwu Diocese du ndị ụka nakwa ndị echichi ibe ya kwanyere ya ugwu ikpeazu na March 21 ma donye ya n'ili na Holy-Ghost Cathedral, Enugwu.Ndị uweojii n'Enugwu ekwola na ha anwụdela ndị ọjọọ gburu Fada Clement Ugwu." media-43352923,https://www.bbc.com/igbo/media-43352923,INEC: Igwe 'card reader' ga-arụ ọrụ nkeọma na 2019,Onye nnọchianya INEC nke Imo steeti bụ Ọkammụta Francis Ezeọnụ bụ onye kwụrụ nke a mgbe ha gara ị kuziri ndị mmadụ maka omume ha na ntuliaka.,"Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka O kwuru na INEC na-agba mbọ ị gbanwe 'card reader' ahụ ka onweike rụọ ọrụ zuru oke na ntuliaka n'abịa. O ji kwa ohere ahụ na-adọ ndị mmadụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị na-asị ha n'oge iji akwụkwọ ntụliaka aghọ aghụghọ a gaala. Ezeonu sị na a ga-ebido ndenye aha na ntụliaka otu mgbe iji mee ka ihe na-aga ọsọ ma hapụ igbu oge. Ọ gwakwara ndị na-azọ ọkwa dị ịcheiche na ndị nkwado ha, sị ha gbaa mbọ gbasa ozi ha nkeọma maka na ohere ị me nrụrụaka agaghị adị ma ntuliaka bido. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47292320,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47292320,Nigeria Elections 2019: A ga m agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị- Eze,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe achụtuola Lawrence Eze bụ onye na-azọ oche Enugwu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu.,"Ụlọikpe achụtuola Lawrence Eze bụ onye na-azọ oche Enugwu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu. Jọstịs Ibrahim Buba onye nyere mkpebi ahụ n'ụlọikpe ukwu d nke etiti nọ n'eEnugwu ụbọchị Tuzde kwuru na ahọpụtaghị Eze nụzọ ziri ezi. Ka BBC Igbo kpọtụrụ Eze na-azọ ọchịchị n'okpuru APC, o kwuru sị ""anyị kwụ chịm"". O kwukwara na ndị mmadụ gbachị akụkọ na-agagharị n'ikuku nkịtị, makana ndị ọkaiwu ya na-akwado ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị. Ọ gara n'ihu gwa ndị na-akwado ya kee nkwụcha ma dị njikere ịtụnyere ya vootu na ntuliaka na-abịa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54884121,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54884121,Ogba mbọ: 'Etu m si eji nsị mmadụ na anụmanụ emepụta gaasị e ji esi nri,Prince Obioma dị afọ iri atọ na abụọ si Imo steeti na-agbanwe ureure wee mepụta gaasị017880 e ji esi nri.,Ọ gwara BBC Igbo na ọ gara mba Kenya ga mụọ ya bụ atụmaatụ ọfụma. O kwuru na Biogas ga-enyere gị aka ka ịghara na-awụsa ureure na bee gị etu ọbụla o si sọọ gị. Obioma kwuru na biogas anaghị agbawa dịka gasi si na mmanụ agbịdị. Gere ya n'uju ebe a. Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a afirika-44777518,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44777518,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ a,Akụkọ ndị dị mkpa.,Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha dị njikere ị tụ ndị ịsị ahịa dị ịcheiche nga maka mkpachị ego kwesiri ị ru gọọmentị aka Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na steeti ahụ bụ Christian Madubuko kwuru na gọọmentị etufuola ijeri naira ole na ole maka mpụ a. Osote onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ David Young arịọla gọọmentị etiti ha mee ihe ga kwụsị oke ogbugbu mmadụ na mpaghara etiti Naịjirịa. O kwuru nke a mgbe ọ gara ị leta aka na-achị Plateau bụ Simon Lalong ụnyaahụ. May: Gọọmentị anyi kwesịrị ime otụtụ ihe Praim Minister mba Briten bu Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ ebe Jeremy Hunt ga-anochite anya Boris Johnson dịka onye odeakwụkwọ mba ofesi N'akụkọ yiri ibe ya Donald Trump ahọpụtala Brett Kavanaugh dịka ọkaịkpe ukwu n'ụlọịkpe kachasị nke mba Amerịka Ngalaba na-ahụ maka bọọlụ na Argentina ekwuola na ha ga-enyocha ọkwa onyenchịkọta otu egwuregwu ha bụ Jorge Sampaoli na ngwụcha ọnwa a. Ebe igwe mmadụ na mba Britain ebidola ị gaa mba Rọshịa maka asọmpị dị n'etiti ha na mba Kroeshia echi. Gee nkeji nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob afirika-43800530,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43800530,Ntuliaka 2019: Keyamo bụ onye nkwuchiteọnụ ịchụnta vootu Buhari,Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye kwupụara ebumnobi ya ịzọ ọchịchị ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019 emeela onye ọkaiwu Festus Keyamo onye nkwuchiteọnụ ndị ga-achụrụ ya nta vootu.,"Festus Keyamo bụ onye ọkaiwu pụụiche na Naịjirịa Keyamo kwupụtara nke a n'akara ya n'igwe twitter ta. N'okwu ya: ""A họpụtara m dịka onyeisi mgbasaozi nke nta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari afọ 2019."" O kwukwara na ya ga-eme mgbasaozi gbasara ya bụ nhọpụta ma emesịa. End of Twitter post, 1 N'akwụkwọ e degara Keyamo nke onyeisi na-ahụ maka ịchụrụ Buhari nta vootu na 2019 bụ Rotimi Amaechi binyere aka na ya, kwuru na ọrụ Keyamo gunyere inye aka hụ na Buhari nwetara nhọpụa site na otu pati ọ chọrọ ịnọ na ya zọọ ya bụ ọchịchị ya na ịhụkwa na o merikwara ntuliaka ahụ. Akwụkwọ ahụ kwukwara na ọ ga-abụ onye nkwuchiteọnụ ndị na-achụ nta vootu ahụ n'otu pati ha nakwa na ntuliaka niile. Cheta na Buhari kwupụtara ebomnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala ọzọ n'izuụka gara aga tupu ọ mee njem gaa mba UK. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53260721,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53260721,"Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ","N'agbanyeghi na ndị omeiwu Naịjirịa sị ka ewezuga mkpebi gọọmenti iwe mmadu 774,000 n'ọrụ site n'atụmatụ akpọrọ ""Special Works Programme"" (SWP) na Bekee, Osote minista na-ahụ maka ọrụ bụ Festus Keyamo, sị na ọ ga-aga n'ihu.","Minista na-ahu maka ọrụ bụ Festus Keyamo sị na ọ bụ puku naịra iri abụọ ka a ga-akwụ ndị iwere n'ọrụ n'usoro a Keyamo na ngalaba ụlọomeiwu Naịjirịa na-ahụ maka ọrụ nwere nghọtaghie n'ụbọchị Mọnde dika ha na-eme mkparitaụka banyere atụmatụ a. Ndị omeiwu sị na Keyamo akwanyereghi ha ugwu dịka nzukọ ahụ na-aga n'ihu, ma mechaa sị ya si ebe ahụ ha nọ pụọ. Keyamo na onwe ya sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ si na ihe na-ese okwu bụ na ya chọrọ ka a kpaa nkata banyere iwe n'ọrụ a n'ihu ndị ntaakụkọ, mana ndị omeiwu chọrọ ka ọ bụrụ na nzuzo. Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu, site n'ọnụ onyeisi kọmitii ahụ bụ Muhammadu Alli Wudil, sị na iwe n'ọrụ ahụ kwụsịgodu makana obi akaghị ha etu esiri chọọ ime ya. Gọọmentị Naịjirịa chọrọ iwe ọtụtụ mmadu n'ọrụ Kedụ etu atụmatụ a siri bido? Dịka webụsaịtị SWP siri kwuo, ọ bụ n'ọnwa Ọktoba nke afọ 2019 ka Onyesiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ hibere atụmatụ a. Gọọmentị sịrị na ọ bụ site n'ụzọ e ji mee ụdịrị ihe a gọọmentị Naịjirịa na otu na-ahụ maka ọdịmma ndị ọrụ na mbaụwa akpọrọ International Labour organisation (ILO). Ọ bụ n'oge ndị agha na-achị n'ime afọ sonyere 1980 ka e mechara nhazi atụmatụ a, mana ọ bụ ugbua ka gọọmentị sịrị na ọ ga-enye aka n'atụmatụ iwe n'ọrụ ka a malitere iji ya mee ihe. Gee olu Toby Okechukwu, onyeomeiwu na-anọchite anya Enugu West Federal Constituency gbasara okwu ndị omeiwu na Ministri na-ahụ maka ọrụ Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ A nwara atụmatụ a na steeti asatọ gụnyere Adamawa, Borno, Ebonyi, Edo, Ekiti, Jigawa, Katsina na Kwara tupu gọọmentị ekwenye ịga n'ihu mee ya ebe niile. Ọtụtụ ndị ntoroọbịa na Naịjirịa enweghi ọrụ Kedụ etu a ga-eji họpụta ndị a ga-ewe n'ọrụ? Dịka Keyamo siri kwuo, ọ bụ mmadụ 1000 ka a ga-ahọpụta n'otu ọchịchị ime obodo na Naịjirịa ga-esonye n'atụmatụ a. Ọ sị na ọ bụ mmadụ 20 n'ime steeti niile ga-ahụ maka ime nhọpụta a. Kọmitii a niile nwere onyeisi nwee onye ode akwụkwọ. Dịka ọ kwụ ugbua, ahọpụtala ndị nhọpụta 20. Lee ebe aha ha na akara ekwentị ha dị ebe a. A na-ele anya na mmadụ 1000 n'ime otu okpuru ọchịchị ime obodo ga-eso na ndi ewere n'ọrụ n'atumatụ a Kedụ ihe ndị a ga-arụ? Ọ bụ ọrụ ileta ihe mmepe obodo gụnyere:" afirika-53350578,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53350578,"Gingivitis, periodontitis na ọrịa ndị ọzọ ga-etinyenwu ọnụ gị na nsogbu","E nwere ike a jụọ gị ọrịa ndị ị ma na-enye nsogbu n'ọnụ mmadụ i kwuo; ọnụ isi, eze ure nakwa eze mgbu, mana ị ma na ọrịa eze nwere ike igbu gị?","Eserese na-egosi eze nakwa akpa asọmmiri Ndị ọkachamara n'ihe gbasara eze, ọrịa na-eso eze na nlekọta ya, na-akọwa na ọ bụghị naanị ihicha eze gị n'ụtụtụ ga-egbochi ụfọdụ ọrịa na-eme n'eze mmadụ. Dọkịta na-ahụ maka eze gwara BBC Igbo na ụfọdụ mmadụ esila n'ọrịa eze laa mmụọ, mana anyị ga-akọwara gị etu nke a si eme. Ị na-ata atụ n'ụtụtụ mana ọ bụ naanị ebe ahụ ka ihe gbasara idebe ọnụ gị ọcha biri? Dkt Olakunle Ogunbayo bụ dọkịta eze kwuru sị na o bighi naanị n'ịta atụ n'ụtụtụ; ihe ndị ị na-etinye n'ọnụ gị na-eso eme ka ị mara ma eze ọ ga-ere gị maọbụ ọ gaghị ere gị. Ọ gara n'ihu kpọpụta ọrịa ndị nwereike imekpa eze gị ahụ nakwa etu ị ga-ezi echekwa eze gị. Lee ọrịa ndị ahụ nwereike ịkpa mkpamkpa n'ime ọnụ gị, ọkachasị n'eze gị: 1) Eze kpọpuru akpọpu/eze ure (Cavities/dental caries): Ụta dị n'eserese a na-egosi eze kpọpuru akpọpu Ị ma ihe ahụ na-acha ọcha na-adị n'eze gị tupu ị saa ọnụ n'ụtụtụ? Ọ bụkwa ya bụ ""plaque"" a na-ekwu okwu ya. Mana mgbe ọ na-abụ nsogbu bụ mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-anaghị asa eze ha hapụrụ ya ka ọ tọkịrị n'eze ha, kpọọ nkụ ebe ahụ dịka foto a na-egosi n'ala. Eze mkpọpu na-esikarị n'ebe nke a kpọrọ ""plaque"" bụ ihe ahụ na-acha ọcha na-anyado n'eze na-amụkọ n'eze onye anaghị ata atụ ọfụma, nri fanyere n'eze, asọmmiri nakwa nje bakteria. Bakteria a na-amụpụta asidi dịka ọ na-erikwa nri ị na-etinye n'ọnụ. Nke a na-eme ka eze gharazie isi ike etu o kwesịrị. Nke a na-emekwa ka ya bụ bakteria na-abanye n'ime ime eze, mee ka okpuru eze ebe a na-akpọ ""pulp"" na Bekee ghere oghe. Eze ghere oghe butezie ọrịa, eze ahụ anwụọ. Ihe ọzọ na-ebute mkpọpu eze a nke na-ebutekwa eze mgbu bụ ịṅụfe mmanya maọbụ nri ndị nwere shuga oke. Mana ị ga-egbochinwu eze gị inwe mkpọpu ma ọ bụrụ na ị na-asa eze gị kwa mgbe kwa mgbe n'ihi na ọ ga-ewepụ ""plaque"" a na-amụkọ n'eze, nakwa site n'igakwuru ndị dọkịta eze bụ ndị ga-ewepụnwu plaque ahụ. 2) ""Ludwig's Angina"": ""Ludwig's Angina"" bụ ọrịa eze nwereike ibute ọnwụ gị ma ị na-akpachaghị anya. Ọrịa a bụ ọrịa na-eme n'ala ọnụ mmadụ, n'okpuru ire nke nwereike ibute ihe a kpọrọ ""tooth abscess"" bụ mgbe abụ banyere n'ime eze mmadụ. O nwekwara ike ịbanye n'ime akụkụ ọnụ ndị ọzọ ọkachasị ma mmadụ nwee ọnya n'ọnụ. Ihe ndị ọzọ na-egosi na mmadụ nwere nsogbu a gụnyere ọzịza ire, olu mgbu na ntị mgbu, ilo ihe nakwa ikwu okwu nwereike ịra ahụ, nakwa mgbe iku ume rawara ahụ ụfọdụ oge. Ọzọ bụkwa na ọ na-ebute ahụ ọkụ, mgbagwoju anya nakwa ike ọgwụgwụ. Gịnị na-ebute ọrịa a? Elekọtaghị eze gị ọfụma, ọnya n'ime ọnụ nakwa ụfọdụ oge ọ bụrụ na efopughi gị eze ọfụma. Gbara gakwuru dọkịta eze ma dịrị ihe a mewe gị, makana o nwereike ibute ọnwụ. 3) Ọzịza ukwu eze (Gingivitis): Gingivitis emeela ka ukwu eze dị na foto a zaa Ọrịa a na-emekarị ndị okenye karịa ụmụaka. Ọ na-abịa mgbe bakteria na-eri n'ọnụ mmadụ mụkọrọ n'ukwu eze mmadụ, nke na-eme ka plaque (nke a na-akpọkwa ""tartar"" maọbụ ""calculus"") ahụ na-amụkọ n'eze mmadụ sie ike. Nke a na-amụkọ ma na-agbasa oghere dị n'etiti eze, ma bute ọzịza ukwu eze. Ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ nwekwara ike ibute ọrịa eze a. Ihe ndị na-egosikarị na mmadụ nwere nsogbu a karịa na ukwu eze onye ahụ zara aza gụnyere na ukwu eze ahụ ga na-agba ọbara ma ọ na-echi eze ya, o nwereike inwe eze mgbu, ọnụ ya ga na-esikwa isi. Ọ bụkwa ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ na-ebu ụzọ egosi na mmadụ enweela nsogbu a kpọrọ ""periodontitis"", nke nwereike ibute mmebisi ihe ndị na-ejide eze mmadụ nakwa mee ka eze na-adapụsị. Ukwu eze gị na-aza aza gbaa mbọ gakwuru ndị dọkịta eze ka ha lee ya anya. Dkt Ogunbayo kwuru na e nwereike isi n'eze mmadụ mara ma o nwere ụfọdụ ọrịa gụnyere ọrịa shuga (diabetes) nakwa nkwụsị ịhụ nsọ na nwaanyị (menopause). 4) Periodontitis: Eze a na-egosi ""Tartar"" na-amụkọ n'eze mmadụ nke na-amakọ n'eze ma ọ bụrụ na anaghị asa eze kwa mgbe Ọrịa a na-esi na ọzịza ukwu eze a na-agwọghị agwọ malite, nke bụ na elekọtaghị eze ọfụma na-ebute ọrịa a. Bakteria na-ebute ozịza ukwu eze, na-ebute periodontitis a bụ mgbe uru anụ na ọkpụkpụ na-ejide eze malitere iri mperi. Periodontitis na-akpa mkpamkpa, ọ na-eme ka oghere dịchaa n'etiti eze nakwa n'ukwu eze dịka foto a dị n'elu. N'afọ 2019 ka ndị ọkammụta sayensị chọpụtakwara na ọrịa a nwereike ibute ọrịa nchefu ihe a na-akpọ ""Alzheimer's"" na Bekee. A na-eche na ọ na-egosikwa na mmadụ nwere ọrịa ogbu na nkwonkwo a na-akpọ ""Arthritis"" na Bekee. 5) Ọnụ isi (halitosis): A ka kwesịrị ịkọwara gị nke a? Ọnụ isi bụ mgbe ajọ isi si mmadụ n'ọnụ na-ekuputa ma o meghee ọnụ. Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ihi elekọtaghị eze nakwa ọnụ ọfụma na-ebute ya, mana ọnọdụ ahụike mmadụ na-ebutekwa ya. Elekọtaghị eze dịka mgbe mmadụ akpachapụghị ihe kpafanyere ya n'eze, bakteria bịazie tinye aka gbarichaa ya, onye ahụ abanye na nsogbu a. Ihe ndị ọzọ na-ebute ya bụ ise anwụrụ, ọnụ asọmmiri kọrọ (dịka mgbe mmadụ anaghị emepụta asọmmiri etu o kwesịrị nakwa ụfọdụ ndị na-eghewe ọnụ oghe arahụ ụra) nakwa ụfọdụ ọgwụ mmadụ na-aṅụ maka ọrịa ndị gụnyere ọbara mgbalieleu nakwa ọrịa mammịrị. Igbochi ya, ị ga na-asacha nakwa na-aghụchasị eze gị ma ị gụrụ gụrụ. Ị ga-agakwurukwa dọkịta eze. 6) Eze iju mmadu n'ọnụ (hyperdontia): E nwereike iji igwe a na-akpọ ""braces"" na Bekee mezie eze gbagọrọ agbagọ Nke a bụ mgbe eze juru mmadụ n'ọnụ, ụfọdụ na-eto ma n'ukwu eze ebe eze ekwesịghị ito. A na-ejikarị ihe nnyocha X-ray achọta ya. Ụfọdụ na-eto n'azụ eze 32 ahụ na-adị onye toro eto n'ọnụ, bụrụzịa ihe a na-akpọ 'eze ịyaramịya'. Ọnọdụ a anaghị afụkarị ụfụ, mana ụfọdụ oge ọ na-eme ka ukwu eze gị zaa aza, nakwa mee ka eze gị ndị nke nọ ọfụma gbagọo agbagọ. Amachaghị ihe na-ebute ya, mana a na-eche na ụfọdụ ọrịa na-esi n'agbụrụ efe mmadụ gụnyere ""Gardner's syndrome"", ""Ehlers-Danlos syndrome"" na ndị ọzọ. Anaghị agwọkarị ya, mana ọ bụrụ na ọ na-enye onye nwe ya nsogbu dịka ma ọ na-ata ihe maọbụ n'ịta atụ, ndị dọkịta na-ewepụ ya. 7) Eze ịkọ mmadụ n'ọnụ (Hypodontia) bụ ndịiche ""hyperdontia"": ""Hypodontia"" bụ mgbeeze karịrị isii bụ nke na-ekwesịghị ịdapụ adịghị n'ọnụ mmadụ. Nke a dịkwa iche na mgbe eze mmadụ ezughi ezu n'ihi na ọ merụrụ ahụ maọbụ na o nwere nsogbu eze. Gịnị na-ebute ya? Ọ na-esikarị n'agbụrụ. Etu e si agwọ ya? Ndị dọkịta eze na-ejikarị ihe ha na-akpọ akwa (dental bridge) ejide eze arụrụ arụ ka ọ ghara ịmịchapụta. Ha na-ejikwa nke a kpọrọ ""dentures"" bụ eze arụrụ arụ, etichi eze ndị ahụ nakwa ""dental implants"" bụ nke yiri ezigbo eze mmadụ a na-esi n'ukwu eze etinye. Ọrịa ndị ọzọ na-enye nsogbu n'ọnụ gụnyere nke a na-akpọ ""Oral psoriasis"" nakwa ""Oral cancer"". Nke a bụ mgbe ọnya na-agbakasị mmadụ n'ọnụ. Kedụ etu i nwereike isi gbochie ọrịa ndị a? Ị nwereike isi n'ụzọ ndị a lekọta eze gị:" afirika-43484402,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43484402,Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi,"N'ala Naijiria, ihe dịka afọ iri atọ maọbụ iri anọ gara aga, a na-ahụ ụfọdụ nri dịka nri ndị ihe na-esiri ike.","Nri ogbenye ọgalanya na-erizi Ọtụtụ nri ndị a bụ nri ndị mmadụ na-enwetara onwe ha n'ugbo ha maọbụ zụta ọnụ ala n'ime ahịa n'ihi na ndị na-achọ ha adịghị ọtụtụ. Mana ugbua, nri ndị a bụzị ihe na-amasị ndị ọgaraanya n'ihi mbawanye ọrịa tara nchara dịka ọbara mgbalielụ, ọrịa shuga, ọrịa obi, ọtụrụọkara (stroke), kansa na oke ibu bụ ọrịa ndị a na-ewe dịka 'ọrịa ndị ọgaranya'. Na nchọpụta ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ mere n'afọ 2008, ndị Naijiria pasenti 11.2 n'ime nde 169 bụ ndị nwere ọbara mgbalielụ ebe pasenti 2.7 nwere ọrịa shuga. Egwu ọrịa ndị a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji alaghachị na nri a na-eleda anya na mbụ nke mere na ugbua nrị ndịa a na-ada oke ọnụahịa nke bụ na aka ụmụogbenye anaghị eruzị ha. Lee 10 n'ime nri ndị ahụ: 1. Azụ friji A na-ahụbu azụ friji dịka nri ndị ogbenye Ihe karịrị afọ iri atọ gara aga, a na-ahụ iji azụ 'friji' sie nri n'ụlọ ndị ogbenye, ụmụakwụkwọ maọbụ mgbe ego adịghị mmadụ n'akpa, ebe anụ ehi maọbụ anụ ọkụkọ bụ maka ndị rijuru afọ. Otu onye bi na Lagos bụ Kingsley Udofa kọwara anya a na-eleda azụ mbụ n'okwu ya sị: ""O nwere oge n'ala anyị bụ Naijiria mgbe azụ friji bụ maka ndị ogbenye. ""Oge ahụ, a na-akpọ azụ friji aha ọjọọ dị icheiche iji kwaa ya emo dịka, 'Ozu azụ' n'asụsụ Igbo; 'Ókù Ékò' n'asụsụ Yoruba nke pụtara, 'Ozu Lagos' ; 'Àkpa asuko nse' n'asụsụ Ibibio nke pụtara, 'ọ nwụrụ anwụ ma mụrụ anya.' Ndị mmadụ na-ahara ịzụ ma rie azụ ndụ."" Ugbua, egwu adagharịala. Azụ friji bụ ahụghị ma erighị nke ọtụtụ mmadụ gunyere ndị ọgaranya nke bụ na azụ na-adazị oke ọnụ n'ahịa. Dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Sen Heineken Lokpobiri siri kwuo, ndị Naijiria na-eri azụ ruru nde 3.2 metrik tọn kwa afọ nke a na-atụbata ihe karịrị pasentị iri asatọ n'ime ya. Mata na metrik tọn puku iri pụtara kọntena puku nari atọ iri atọ na anọ. 2. Ede Ede na-agalazị oke ọnụ Ọ bụ ede ụrị ka ọ bụ ede koko ma ọ bụ achịcha, ede bụ nri ụganị, nrị ndị onweghị ka ọra ha ji agbado ume n'ihi na ha enweghị ego zụrụ ji. Mana ugbua, nri ede bụzị ụkwa achị n'aka ya a na-agba n'ihi na oke na ngwere na-erizi ya. Ewepụ obodo jiri ụtaraede mere nnukwu nri, ndị na-asọ nsọ nrị n'ihi ọrịa dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalielu na ndị chọrọ ịta ahụ ekweghịzị ka aka ogbenye rute ede, nke na i go ede e ji esi ofe dịzị ka igo ahịa iwu. 3.Kanda Akpụkpọanụ ehi nke ndị Yoruba na-akpọ, 'kpọmọ', bụbu ihe ndị ogbenye ji emegharị ọnụ oge ha ahụghị ego zụrụ anụ ehi ma maọbụ anụ ọkụkọ. Dịka ihe si aga ụgbụa, ndị ọgaranya ewerela ya mee ezi nri, ebe e ji ya esi nri ọpụrụiche dịka edikakong maọbụ gwọ ya na ose ma were ya anụ mmanya. N'afọ 2014 mgbe gọọmenti si n'ọnụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Akinwumi Adesina kwuo na ha chọrọ ịmachi ndị mmadụ iri kanda nke butere oke iwe ndị mmadụ ma mekwa ka gọọmenti kpofuo atụmatụ ahụ n'ọhịa. Dịka ndị ọkachamara sị kọwa, kanda enweghị abụba maọbụ mmanụ ọjọọ a kpọrọ kọlesịtọrọl na bekee dịka anụ ehi nke ha kwuru na oke iri ya na-ebute ajọ ọrịa tara nchara dịka ọrịa obi na ọbara mgbalienu. 4. Ojoko Ụfọdụ na-akpọ ya ogede, ụfọdụ abịrịka, ndị ọzọ ojoko, ebe ọtụtụ na-akpọ ya une maọbụ unere. Ụmụ ogbenye na-eji mmanụ eri nke ahụrụ n'ọkụ, ma jiri ya sie agwa mana ugbua, ọgaranya emeela ojoko nnukwu nri. Ojoko bụ ezi nri na-edochi ahụ nihi na o nwere faiba, na mineral ndị ọzọ na-enyere ndụ aka dịka magnesium, phosphorous na potassium. Dịka ndị ọkachamara ahụike siri kọwa, ojoko na-enye ọbara mgbe e siri ya na-achaghị acha. 5. Ejula Ejula bụ ezi nri na-enye ihe n'ahụ ma ọ na-adazi oke ọnụ ugbua Ma anụ adighị, azụ adịghị, ogbenye na-aba n'ọhia kpara ejula, were sie nri. Ogaranya, enwebughị efe ejula mgbe mbụ n'ihi na, dịka ndị Igbo ji ya ekwu okwu, ahụhụ dị na imecha ejula. Ma ugbua, iji ejula isi nri bụzị akara ejiri mara ọgaranya n'ihi oke ọnụ ahịa ya. Ejula bụ ezi nri nwere proten, calcium, selenium, magnesium ma na-enye ọbara. 6. Garị Garị bụ nri ma ogbenye ma ọgaranya na-erizi Iri garị, ọ kachasị mgbe aṅụrụ ya aṅụ, bụ ihe a na-ewe dịka nri ndị ụwa na-atụ n'ọnụ maọbụ mgbe ego kọrọ gị n'akpa na mbụ. Ị jụọ ụmụakwụkwọ bi n'ụlọakwụkwọ ha ga-akọwara gị etu ịji ọpapa, azụ e ghere eghe maọbụ anụ mkpọ aṅụ gari si zọọ ha ndụ. Ugbua garị bụzị ahịa iwu. Ọgaranya na ogbenye na-azọzị garị nke otu ọba a na-akpọ 'painter' na-ada ihe karịrị nari naira ise (N500). Onye ọkammụta ọrịa kansa n'ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital, bụ Dr Remi Ajekigbe kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị Naijiria ji arịa ọrịa kansa ugbua bụ na ha anaghị erizi nrị ala anyị dịka garị, ji nke nwere faiba ka ma ha na-eri nri ndị bekee. 7. Agwa Agwa bụ ezi nri na-edozi ahụ Agwa bụ nri ọzọ e jiri mara ndị ogbenye mana ọtụtụ ọgaranya na-erizi ya. Agwa na-enye proten ma na-enyekwa ọbara. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye na-ekwu na agwa kacha mma maka nweta protein karịa anụ ehị n'ihi na onweghị abụba ọjọọ nke a kpọrọ Kọlesịterọl. 8. Ukwa Ụkwa bụ oke oriri pụrụ iche onye ike dị na-akwado Ụkwa bụ nrị ndị ọgrlanya na-eleghara anya na mbụ, ikekwa n'ihi ahụhụ dị na-ikwado ya, mana ugbua, ọ bụzị onye ji ego na-eri ụkwa. Ụkwa na-enye proten, ọbara, potassium nakwa ngwa ndị ọzọ na-edozi ahụ. 9. Ji mmiri Ji mmiri nwere fibre Ji mmiri bụ nri ndị mmadụ anaghị erikarị na mbụ n'ihi na ọ naghị atọ ka ji. Sọọsọ ndị ogbenye jibu ya achụ agụụ. Mana ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ gunyere ndị ọgaranya na-eri ya. Ndị na arịa ọrịa shuga na-erikwa ya. Ndị nchọpụta na-akọwa na ji mmiri nwere fibre rie nne, obere ""sodium"" na nnukwu ""potassium"" nke mere e ji kwuo na ọ na-adị ndị na-arịa ọrịa shuga mma n'ahụ. Cheta na ""fibre"" na-enyere nrị aka igwepịa n'afọ (digestion), oke ""sodium"" so ebute ọbara mgbalienu, ebe ""potassium"" na-akụjulata ọbara, chụmie mmadụ inwe ọrịa okwute akụrụ (kidney stone). 10. Isha Isha na-adazị oke ọnụ nke na aka ụfọdụ ogbenye eruzi ya Ndị enweghi ego na-ejibu isha esi nri oge ha e nweghị ego anụ maọbụ azụ, ma ugbua, isha bụzikwa maka ndị nwere ego n'ihi oke ida ọnụ ahịa. Ihe mere ndị mmadụ ji achụzị nrị ndị ogbenye 'Ihe mere ọgaranya ji erizi nri ndị ogbenye' Dika ọkammụta na ihe gbasara nri na ihe ọ na-arụ n'ahụ bụ Dr Florence Uchendu si kọwa ihe mere na ọtụtụ ndị mmadụ na-eri nri a na-agbara ọsọ ugbua karia bụ maka na ọrịa dị na Naijiria ugbua dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalienu, ọtụrụọkara(stroke), kansa. ""Ọrịa dịzị na Najiria bụ ọrịa dị n'obodo oyibo anyị anaghị arịabu mbụ. Ihe dika ọbara mgbalienu, ọrịa shuga juziri kịta."" ""Ndị mmadụ amatago ihe ị ga-eri onyewe gị nsogbu n'ahụ ma nwekwa ike nyewe gị nsogbu n'ahụ."" Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-52217328,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52217328,Coronavirus Lockdown: 'Gọọmentị Amerịka nyere anyị ihe anyị ga-eji nọrọ n'ụlọ',Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe akwa na Naịjirịa na gọọmentị enyeghi ha ihe iti aka n'obi dịka e mechiri obodo n'ihi coronavirus.,"N'oge a, ọtụtụ enweghi ọkụ ne be ha, ha enweghị ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Mana ndị Naịjirịa bi na mba Amerịka na-ekwu na gọọmentị obodo ahụ nyere ha ihe niile dị ha mkpa iji nọrọ n'ụlọ. Lee ezinụlọ a gwara BBC Igbo etu ha si nọrọ n'Amerịka." afirika-47032641,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47032641,Onnoghen: Senate akagbuola nzukọ ha ka NBA malitere abụbụ ọrụ,"Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naijiria bụ NBA na aha ịchafụ agwala ndị otu ha ka ha jụ ịga ụlọikpe site n'ụbọchị Tuzde nakwa Wenezde, bụ echi na nwanne echi.","SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria Nke a bụ otu n'ime nkwekọrịta ndị otu a mere na nzukọ ha mere taa n'Abụja. Otu a katọkwara mwepụ ọchịchị etiti wepụrụ nnukwu ọkaikpe Naijiria bụ Walter Onnoghen n'ụzọ iwu akwadoghị. Ha wepụtakwara otu kọmiti mmadụ atọ mejupụtara bụ ndị gụnyere Olanipekun, A.B Mahmood nakwa onyeisi ha bụ Paul Usoro, iji leba anya n'okwu a. Na nke a na-eme, ndi ọkaiwu Naịjirịa ekwuola na ha agaghị alaghachi ọrụ eche maka okwu Onnoghen a dịka ha sibu kwuo. Atumatu ọhụrụ a si n'oche onyeisi ụlọ omeiwu bụ Bukola Saraki sị na ha ga-alaghachi ọrụ ụbọchị 19 nke ọnwa Febụwarị, bụ mgbe emechara ntuliaka nke 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" 44617515,https://www.bbc.com/igbo/44617515,Ọgụ Izzi na Ukelle: Lee ihe onye ntaakụkọ BBC hụrụ,"Ndụ adịghị n'Igbeagụ dị n'Ebonyi steeti ebe ndị obodo ahụ eleghi anya n'azụ wee gbaa ọsọ ndụ hapụ ụlọ ha, ụlọakwụkwọ, ahịa na ihe niile ha nwere.Ha gbagara obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu maka ụjọ na ndị Ukelle ha na ha nwere nsogbu nwere ike ịbịa ọgụ.","Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ Ọtụtụ ahịa dị icheiche na ụlọakwụkwọ dị n'Ochafu, Amuzu, Eteguideigwe bụ nke ndị mmadụ hapụrụ gbaa ọsọ ndụ. Ọtụtụ ụmụokoroọbịa na ya bụ Izzi zukọrọ ebe dị icheiche kwuru na ha agaghị ezu ike ganye na ha abọ ọbọ ndị e gburu. Ndị mmadụ bu akpa ha agbapụ ọzọ agbaga obodo ndị ọzọ Ahịa tọgbọrọ chakoo Ha kwukwara na ha na-achọ ihe karịrị mmadụ otu narị ndị ahụbeghi ozu ha. Onye Eze na-achị Izzi bụ Eze Michael Ukwa kọwara na nsogbu ahụ dị n'etịtị ha na ndị Ukelle dị na Kross 'Riva bụ ala dị n'ikpere mmiri dị n'oke ala ka a na-azọ. Ọtụtụ ndị mmadụ agbafuola n'ụlọ ha maka ọgụ a O kwuru na esemokwu ahụ malitere kamgbe afọ 2005. Eze Ukwa kwara arịrị na ya onwe ya nọ na nsogbu maka na ya gwara ndị ntoroọbịa obodo ya agala ọgụ. Ndị ọrụ agha na ndị uweojii anọchiela obodo abụọ ahụ na-alụ ọgụ. N'okporouzọ awara awara si Abakaliki aga Ogoja, ndị ọrụ nchekwa ahụ ji oke osisi gbachisịa ụzọ iji gbochie ndị Ukelle ịbata n'Izzi ma kwụsịkwa ndị Izzi ibanye n'Ukelle. E ji ihe gbochie okporoụzọ Mgbe BBC batara n'ime obodo ahụ, ọgụ ahụ ka na-ada bụ na Ndịalobo dị n'Izzi, ụmụokorobịa karịrị mmadụ ịrị anọ gbachiri ụzọ n'ahịa eke Ndịalobo, ma jụ inye BBC ohere ibanye ebe ha gbara ụlọ ọkụ. BBC Igbo laghachịrị azụ wee chọọ isi n'ụzọ awara awara banye, mana ụmụokorobịa obodo ahụ chụrụ ha ọsọ. Ndị uweojii ahụ gbachiri ụzọ n'oke ala Krọs Riva na Ebonyi, bịazịrị nyere ndị ntaakụkọ BBC aka ịgba ọsọndụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45771538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45771538,Chimamanda Adichie na-eduhie ụmụagbọhọ anyị- Atuejide,Eunice Atuejide so na ndị na-azọ oche onyeisala Naịjirịa ekwuola na okwu Chimamanda Adichie na-ekwu ụfọdụ oge na-eduhie ụmụagbọghọ.,"Atuejide ekwenyechaghị n'okwu ufọdụ Chimamanda na-ekwu O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ onye ntaakụkọ akpọrọ Daddy Freeze na-agba ya n'elu igwe okwu. Ihe o kwuru, ""E chere m na Chimamanda na-emebiga ihe oke, e chekwaram na-eduhie ọtụtụ ụmụagbọghọ Naijirịa."" ""Ọ bụghị mgbe niile ka na-ekwenye n'ihe ọ na-ekwu makana ụfọdụ oge ọ na-tụ m n'anya okwu na-esi n'ọnụ ya apụta."" Atuejide kwuru na ọ na-eche na ọ bụghị mgbe niile ka ụmụagbọghọ ga na anabata okwu niile Chimamanda kwuru makana ọ ga na-emegide ha echi. Kamgbe o kwuchara okwu a, ndị mmadụ na soshal achịrị na ọkụ so ya, ebe ụfọdụ kwenyere n'ihe o kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51848012,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51848012,Akanu Ibiam Airport: Lee ihe minista njem hụtara maka ya bụ ọrụ,Minista na ahụ maka njem ụgbọleụ bụ Hadi Sirikana ndị ọrụ ya gara njem nleta na ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam n'Engwu taa bụ Tọzde ịmata ka ọrụ sị aga na ya bụ ebe ahụ.,"Minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika n'Ọdọụgbelụ Akanu Ibiam Enugwụ Lee ga ya bụ nyocha siri gaa Ọrụ na ọdọ ụgbọelu Akanụ Ibiam South East: South East Development Commission ọ ga-apụta ihe? Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itinye ọnụ n' okwu gbasara ihiwe ngalaba puruiche maka ọwụwa-Anyanwu a 'kpọrọ South East Development commission.' Ndị Ụlọmeeiwu si ọnwụ wanya kwadoro akwụkwọ iwu a nke Stella Oduah nke Anambra Nọt tinyere si na ọ ga-enye aka maka mmepe ala Igbo niile. Okporoụzọ Enugwu gara Onicha Gọọmenti etiti amapụtala ijeri naịra iri abụọ na itoolu na uma maka ịrụgharị okporo ụzọ awarawara sị Onitsha gawa Enugwu. Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola sị na- anapuru ndị ọrụ ngo mbụ ji ya bụ ọrụ maka amaghị eme ha. Saụt Sudan N'Afrika, a turu anya na mba Saụt Sudan ga-akpọpụta aha ndị ọchịchị echi bụ Faịde. Ndị a ahọpụtara bụ ndị ga-ejigodi ọchịchị nwamgbenta tupu ha emee ntuliaka dịka onye isi ndị Joint Monitoring and Evaluation Commission bụ Augostino Njoroge si kwuo. Coronavirus na Ọstralịa Egwuregwu Grandi Pix bú egwuregwu nke abụọ ana akagbu maka Coronavirus Dịka ọrịa Coronavirus na-akpa mkpa na-aga n'ihu, akagbuola egwuregwu Grand prix nke kwesiri ịbịa na Ọstrelia. Nke a na-eme dịka otu onye n'ime ndị kwesiri isonye bụ egwuruegwu butegoro ya bụ ọrịa. Gịnị ka 'pandemic' pụtara? Ngalaba na-ahu maka ahụike mba ụwa niile bụ World Health Organisation eji WHO mara ekwuola na ọrịa Coronavirus abụrụla 'Pandemic'. Kama ọtụtụ na-ajụ sị ""Gịnị bụ dị Pandemic a?"" Ụfọdụ na-ama ahụ riri n'ụjọ maka coronavirus ị bụzị Pandemic mana eziokwu bụ na Pandemic pụtara ọrịa na esi na ahụ mmadụ banye n'ahụ onye ọzọ. Nke a na-ekwu na Pandemic pụtara na ọrịa agbasaala ụwa niile. Mgbe ọ bụla WHO kwuru na ọrịa bụ Pandemic, ọ pụtara na WHO na mba ụwa niile ma tinye kwa ndị Sayencị dị iche iche na-arụkọ igbochi ya bụ ọrịa. Nanị ihe WHO chọrọ ịme maka mkpọpụta bụ ka mmadụ niile nwee ahụike. Pandemic na-egosi etu ọrịa siri gbasaa ma ọ bụghị na ọ na-egbu mmadụ karịa. Tom Hanks na ndị ọzọ ama ama bu Coronavirus Onye na-eme ihe nkịrị ama ama bụ Tom Hanks na nwunye ya bụ Rita Wilson ebutela Coronavirus. Dị na nwunye abụọ a gbara afọ iri isii na atọ ewepụla onwe ha iche maka nchekwa na ọgwụgwọ ya bụ ọrịa. Tom Hanks mere ihe onyonyo dịka ""Forest Grump"" na ""Castaway"" bụ ide na Hollywood. Ya na nwunye ya butere ya bụ ọrịa dịka ha gara mba Ostralịa. Tom Hanks kọwara na ya na nwunye ya nwere ike ọgwụgwụ, azụzụ na ahụ mgbu nke mere ka ha mee nyocha. Ọ bụ nyọch a ka ha mere were mata na ha bu ọrịa Coronavirus. Lee ihe ọ depụtara na Instagram ya ""Anyị agaghị amachi ndị mbịarambịara ọbụla""- Gọọmentị Naịjirịa Gọmentị Naịjirịa ekwuola na o nweghi onye ha ga-akwụsị ịbata na mba a dịka ọrịa Coronavirus jisi ike efesa na mba dị icheiche. Kama ha kwuru na onye ọbụla si mba Italy, China, Iran, South Korea na Japan nata ga-aba Quarantine ụbọchị iri na anọ tupu atọghapụ ha. Na mba ofesi Ebidola nrụpụta ngwaọrụ nwereike ịnyochapụta ọrịa Coronavirus n'ime nkeji iri na mba Senegal. Ndị sayensi na-eme nyocha na-ekwu na e nwereike iweputa ya n'ọnwa Juun maka ndị chọrọ ịnyocha ngwa ngwa. N'egwuregwu, Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Cristiano Ronaldo abanyela Quarantine na be ya na Madeira mba Spen dịka akụkọ pụtara na onye otu ya n'otu Juventus bụ Daniele Rugani bu ọrịa Coronavirus. Ronaldo gara mba Spen ịleta nne ya rịachara ọrịa mkpọnwụ ahụ. Gee akụkọ ụwa na nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Nadine Dorries bụ Minista Ahuike mba Briten Nadine Dorries bụ Minista ahuike mba Briten Minista na-ahụ maka ahuike ndị mba Briten bụ Nadine Dorries ebutela ọrịa coronavirus. Dorries onye dị afọ iri isiina abụọ kwuru na ọ wepụrụ onwe ya iche n'ụlọ ya mgbe ọ chọpụtara na o bu ya bụ ọria Coronavirus. Mịnịsta Dories bụ onye mbụ bụ onye omeiwu Briten bu ọrịa Coronavirus. Ndị bu ọrịa a na mba Briten eruola mmadu narị atọ iri asatọ na abụọ ebe mmadụ isii lagoro mụọ maka ya bụ ọrịa na Briten. Dịka ọ dị ugbua, Dorries kwuru na akwụkwọ ọ depụtara na ngalaba na-ahụ maka ahuike ebidola ịchọpụta ndị niile ha na ya nwere mmekọ. O kwu kwara na twitter ya were sị ""Ọ bụchaghị ihe nwere isi, ebum n'obi na nke ka njọ agafela...kama ọ bụ nne m gbara afọ iri asatọ na anọ mụ na ya bị bidoro kwọwa ụkwara ka ụche m dị."" Ihe ọ depụtara na Twitter ya. Daniele Rugani na agbara ndị Juventus na mba Ịtalị bọọlụ Amachiela asọmpị niile na mba Ịtalị Ọnye na-agbara ndị mba Italị na otu boolụ Juventus bụ Daniele Rugani ebutela ọrịa coronavirus. Dịka ọ dị ugbua. Ewepụla Ruganị na Quarrantine ma ndị ọzo kwa ha na ya nwere mmekọ. Lee ihe onyonyo ọ wepụtara na Twitter ya ebe ya na ndị otu ya na aṅụrị mmerị ha meriri Inter Milan. Evangelos Markinakis bụ onye nwe otu Olympiakos na Nothingham Forest Ọ bụ mgbe Markinakis sị mba Greece lọta ka o gosiri njirimara ya bụ ọrịa coronavirus Evangelos Markinakis gbara afọ iri ise na abụo bụ onye nwe otu bọolu abụo bụ Nottingham Forest na Olympiakos. Dịka o siri kwuo na Instagram ""Nje ọrịa bụ coronavirus biara lee mụ ọbịa m were sị ka ndị mmadụ mara"". King Paul Akpan Udoh Nwaafọ Naijirịa aha ya bụ King Paul Akpan Udoh ebutela ọrịa CoronaVirus. Udoh na-agbara ndị otu Pianese na 'Serie C' ndị mba Itali. Dịka ọ dị ụgbụa, ewepụla ya si n'ebe ọha nọ pụọ nke bekee na-akpọ ""Quarantine"". Akụkọ na-ekwu na enwere mgbe ndị otu Juventus Chọburu ịgote ya mana ọnweghị isi. Ndị egwuregwu bọọlụ na-atụ ụjọ na enwere ike ị sị ha sọo asọmpị n'ebe ha nwereike ibute oria a. Mana ka ọ dị ụgbụa, eyiharịala ụfọdụ asọmpị nke dịka AFC Champions league maka ọrịa Coronavirus. Uganda na Coronavirus Onye nọ na ebe e sị abata Uganda Mba Uganda enyela iwu na ndị ọbụla sị mba iri na isii ha depụtara nke gunyere Amerịka na Briten ga-anọ Quarantine ụbọchị iri na anọ. Nkea na-abịa dịka Minista Uganda na-akọwa na ụloọgwụ ha na Akụnauba ha agaghị ebulị ọrịa Coronavirus ma ọ wakpo ha n'ike. Abụbọ ọrụ ndị ASUU Goọmentị Naijirịa ekwuola na abụbo ọrụ ngalaba jịkọtara ndị nkuzi mahadum na Naijirịa bụ Academic staff union of universities bụ ASUU megidere iwu. Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naijirịa bụ Chris Ngige kwuru nke a were sị na ọ bụ maka na ASUU agwaghị goọmentị tupu ha ebido abụbọ ọrụ ha. N'Egwuregwu Coronavirus awakola egwuregwu Basket ball na mba Amerịka Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nkata bụ Basket bọọlụ amchiela asọmpị Basket bọọlụ niile dịka optu onye na atụrụ ndi otu Utah Jazz butere ya bụ ọrịa." afirika-49950469,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950469,Big Brother Naija: Lamborghini Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija,N'ikpeazụ 'Lamborghini' Mercy atụrụla ugo dịka Ugoeze n'ihe emume onyonyo nke Big Brother Naija.,"Mercy Eke bụ nwaanyị mbụ na-emeri BigBrother Naija Dịka ọgụ, mgba, oge ịhụnanya nakwa esemokwu mere n'ime ọnwa atọ gara aga, Mercy meriri Mike iji bulie agbaego a na-ala. A chụpụrụ Frodd, Seyi na Omashola n'emume n'abalị ụbọchị ụka bụ ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba 2019, tupu a kpọpụta aha Mercy. Cheta na ihe emume a ji mmadụ iri na ise malite n'ụbọchị 30 Juun, afọ 2019 rue taa otu onye pụtara dịka ọkaibe. Kwado nụ onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo ekwuola na ọ dị mfe onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 karịa inweta Biafra. N'ime akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Okechukwu Isiguzoro na odeakwụkwọ ha bụ Okwu Nnabuike wepụtara, otu a kpọrọ okuka ndị Ipob nakwa ndị Igbo niile gbakọta aka iji họpụta nwafọ Igbo dịka onyeisiala. Otu gara n'ihu kwuo na ha ga-enye ndị mpaghara ndị ọzọ ngarị iji mee ka ha dọnyere ndị Igbo ukwu ịhọpụta onyeisiala. Ohanaeze Ndigbo kwuru na ha ga-arịọkwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha họpụta onye Igbo ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala. Gọọmentị akwụwala ụgwọ ọnwa opekatampe - Ngige Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti amalitela ịkwụ ndị ọrụ ogodo ha kachasị nta ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra atọ. Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ ka na-arọzi olu maka nke ndị ọrụ nọ n'ogogo dị elu. N'ofesi Otu nwoke ji egbe agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ ise ahụ n'otu ụlọ a na-aṅụ mmanya n'obodo Kansas dị n'Amerịka. Ndị uweojii gwara ndị ntaakụkọ BBC na nwoke na-asụ asụsụ ndị Spen riri mbọ mbọ ọsọ ngwa ngwa ọ gbachara arụ a. N'egwuregwu Wolverhampton Wanderers ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu lụọ ndị Manchester City dịka nwụnye n'asọmpi Premier League. Chelsea ji ọkpụ anọ asatara otu tie Southampton mmọnwụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ merie Bournemouth. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri South -East Roads: Ndị njem atọla n'Ugwuoba n'ihi ọjọọ Gọvanọ Borno akpọla ndị nsọ ga-eji ekpere chụpụ Boko Haram Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kamgbe afọ 2015. Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ahọpụtala ndị ekpere 30 bụ ndị ọ sị na ha ga-aga ala nsọ bụ ebe ha ga-eje kpọpee ekpere dị ekwụ bụ nke ga-ememila Boko Haram na steeti ahụ na ndị nọ ya nso bụ ebe ọrịa Boko Haram ji aka. Nke a si na ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Gọvanọ bụ Isa Gusau bụ onye kwuru na ndị ekpere iri atọ a adịla njikere ị ga ala nsọ ha na Saụdị Arebia bụ ebe ha ga-anọ kpọpee ekpere ga-ememila ndị omekaome a. Gusau kwuru ụbọchị Satọde na "" Gọvanọ Babagana Umara Zulum na ndị ekpere iri atọ bị na Makkah enweela nkwekọrịta maka ị kpe ""Dawaf' kwa ụbọchị maka ịmemila Boko Haram na steeti ndị ọmetutara"". O kwughị ma ego eso na ya bụ nkwekọrịta mana ọ sị na ndị ekpere a sị Borno, Katsina, Zamfara nakwa Kano steeti. O kwukwara na ndị nsọ a bụ ndị tagoro ọjị ụwa n'ekpere bụ ndị nọgoro ihe ruru afọ iri anọ na Ka'aba bụ ụlọnsọ ha na-efe Chukwu. Ka'aba bụ ebe kacha nsọ na Al-Haram Mọsk dị na Makkah. Gusau sị na ekpere ndị a ga-enyere ndị agha aka imeri Boko Haram kpamkpam ma wetakwa udo tọrọatọ na Steeti ha. Isreal Adesanya eturula ụgọ UFC243 middleweight Isreal Adesanya eturula ugo UFC middleweight Isreal Adesanya nwaafọ Naịjirịa nke a na-etu ""Last Stylebender"" akụpụla Robert Whittaker mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maburu mbenaukwu nturugo nke UFC middleweight championship nke na-akpọtụ na ọgbọọgụ Melbourne, Australia. Adesanya ji iwe kụpụ Whittaker anwuru n'anya nke Bekee kpọrọ ""knockout"" n'agba nke abụọ. Ọ kpara ike a site na ịkụ ya ọkpụ 3:33 bụ ebe ọ nọ menye ya bụ nwoke ihere n'ihu mmadụ puku iri ise na asaa. Mmeri a mere ka ọ rigoro na ogoogo 18-0 bụ nke mere o jiri bụru ọkaibe na ya bụ ""middleweight"" Adesanya gwara Jon Aik bụ onye nkọwa nke ọkpa ahụ "" ọbara gbaburu m n'ime, ụgbụa nke ya agbawala ya"". Nwafọ Naịjirịa bụ onye na-anọchite mba New Zealand bụzị onye ji mbenukwu nke ""middleweight title"" na egwuregwu UFC 243. Ọsọ tara na mmeme BBC 1 Extra na Birmingham Arena Obi ọjọọ ji ndị mmadụ ụnyahu bụ Satọde ka ndị amakekwu tisara mmeme ndị BBC 1 Extra kpokobara na Birmingham Arena. Ya bụ ahịa họrọ onyeukwu na onyenta ebe ihe ruru mmadụ 15,800 kwuru ụkwọ ya bụ mmeme gbara aka lawa na-ekirighị ihe ha jiri bịa. BBC 1 Extra buputara egwu ndị ọhụrụ nakwa nke dị ochiedike dị n'egwu bụ nke azụchara oche niile dị n'Arena. Mmadụ dịka Aitch, French Montana, Ms Banks, Wizkid na ndị ọzọ bụ ndị buputara egwu ha ọgbọ. Mana ọrụ kụrụ akụ. Otu onye n'ime ndị BBC kpọrọ bịa ya bụ egwu bụ onye ọmambem Bekee akpọrọ Krept bụ onye asị na-akụrụ ihe na ya bụ emume eji kagbuo ya. Akụrụ Krept ihe na mmeme BBC 1 extra ụbọchị Satọde Ya bụ nwaadị gbara afọ 23 azaala n'akara Twitter ya na ya enweghị nsogbụ ọbụla. Dịka ndị uweojii na-ama ime n'ala ka ha chọpụta nke bụ eziokwu na ndị mere ya bụ ihe, ha sị na ya bụ nwaamadị emerughị ahụ ọbụla. Ala ọmajiji n'Alayi Ndị Isiaku Alayi dị na Okpuruọchịchị Bende nke Abịa steeti chizi obi na aka dịka alaọmajijii mebichara ugbo na ụzọ ha. Eze Uche Akukwu nke mbu na Alayi akpọkuola Gọọmenti ukwu ma nke nta ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ụganị nke nwere ike ịdakwasị ha maka ọdachi a. TUC amala ọkwa abụbụ ọrụ Ndị Naịjirịa kee nkwụcha chebiri abụbụ ọrụ kacha abụbụọrụ site n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọktoba. Onyeisi ndị Trade Union Congress bụ Quadri Olaleye kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti etiti elebeghị anya na ibuli ụgwọ ọnwa ndị isiọrụ bụ nke ha bidoro ịgba ụgwọ ya kemgbe na egwu ga adị. O gbugbu mmadụ na mmeru ahụ a ezuolanụ! Otu na ndị isi United Nations bụ Jeanine Hennis-Plasschaert tiri mkpu maka otu narị mmadụ egbugoro na mba Iran site na ngagharịiwe amalitere kemgbe izuuka. Ndị Iran na-eme ngagharịwe maka agụ, enweghị ọrụ na mpụ ha sị na ọ ka nkụ na obodo ha. Arsenal na Bournemouth N'egwuregwu, taa bụ oke ụbọchị na Premịa Lig dịka Arsenal ga-ezute Bournemouth, Man City na Wolves ga-ezute onwe ha. Southampton na Chelsea ga-akwata ebe New Castle na Manchester United ga-ama ọkaibe. Gee akụkọ anyị n'otu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47574373,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47574373,"2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu, edere ya ede - Mbaka","Ụkọchukwu a ma ama bụ Reverend Father Ejike Mbaka, ekwuola na ndị Enugwu kwesịrị idenye Buhari vootu gbagotara n'ọnụọgụgụ karịa oke e nyere ya.","Mbaka boro ebubo na ndị Enugwu ji aka ha denye Buharị ọnụọgụgụ na-ebughi ibu, ma kwuo na obi dị ya ụtọ na Buhari mechara merie na ntuliaka, ""ihere wee bụrụ nke ndị iro ya"". Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Atiku na Peter Obi atụnyereghị ụlọụka ya , ha nwere ike ị da na ntuliaka na-abịa Mbaka gwara Ayogu Eze sị ya ntọọ, na ọ gwara ya ka ọ ghara ịzọ ntuliaka dịka gọvanọ, mana o geghi ya ntị. Ọ gwara Ayogu Eze na nnukwu ọnụọgụgụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi jiri merie ya kwesịrị ikuziri ya na enwere mbe na abọ nke bụ oke. Mbaka dọrọ ndị na-akatọ ya aka na ntị ka ha ghara itinye onwe ha na nsogbu nke chukwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43436960,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43436960,Otu nwoke na-akwado Chelsea awụọla na Ghana,"Otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Offin bụ onye ala Ghana dara n'ala, nwụọ oge Barcelona meriri Chelsea n'asọmpị iko Champions League agbara n'ụbọchị Wenezdee 14 Maachị.","Chelsea bụ otu nwere nnukwu ndị na-akwado ha na Afịrịka Akụkọ kwuru na mkpamkpa a mere n'obodo Kumasi, oge Offin sị ebe ọ gara ikiri asọmpị a na-alaghachị bee ya. Ndị ezinaụlọ ya kwuru na Offin dị afọ 24 bụ onye na-akwado Chelsea ọfụma ọfụma. Ha kwukwara na ọnwụ Offin tụrụ ha niile na-anya nke ukwu. Chelsea apụọla n'asọmpị iko Champions League n'agba nke 16. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48729281,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48729281,Miyetti Allah: Nwodo sị 'ndị na-wakpo' Ọwụwa Anyanwụ abụghị ndị ga-echekwa ya,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a,"Ohaneze si Miyetti ekwuzikwana na ha chọrọ ichekwa Ọwụwa Anyanwụ Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndịgbo awụọla mmiri oyi n'atụmatụ ndị Miyetti Allah wepụtara n'Enugwu mgbe ha zutere aka ndị na-achị steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ, Maazi Nwodo sị na ihe gbagwojuru anya n'atụmatụ a bụ na ọ bụ ndị ọ sị na-wakpo Ọwụwa Anyanwu na-ewete ya. ""Ọ bụ ndị a na-emebi ugbo anyị, edina ụmụnwaanyị anyi n'ike am na-egbu di ha. Onweghị ihe na-eme ndị makana ọ dị ka ha karịri obodo ike."" Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu bu onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu bu onye sị na ya amaghị etu otu ndị na-atụ mgbere dịka Miyetti bụ ga-eji na-eme nzukọ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwu nke ndị na-achị Ọwụwa Anyanwụ ga na enye ha ohere ịbịa ụdịrị nzukọ a."" Osote Odeakwụkwọ Ohaneze bụ Chuks Ibegbu tinyekwara ọnụ gwara BBC Igbo na ya bụ ihe agaghị ekwe omume belụsọ ma ndị Ugwu enyere ohere ka otu Ipob na Massob bido ọrụ nche n'Ugwu Awusa. Ibegbu sị na ọdịghị mma ịnụ na ntị na ndị mba ọzọ ga-abụ ndị na-eche ala Igbo nche. O kwuru sị ""Ọ bụrụ na ndị ugwu ga-ekweta ka ndị Igbo bia chewe ha nche n'ala ha, mgbe ahụ anyị ga-ekweta ka Miyetti Allah bịa chewe ala Igbo nche."" Odeakwụkwọ otu Miyetti Allah bụ Alhaji Baba Ngelzarma bụ onye kwuputere ebumnuche otu ahụ n'ọgbakọ nchekwa e nwere n' Enugwu ụbọchị Tọọzdee nke otu 'South East Chambers of Commerce, Mines and Agriculture,' (SECCIMA) na otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ jikọrọ aka were hiwe. Oshiomhole adọọla gọvanọ Bauchi aka na ntị Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Onyeisi party APC adọọla gọvanọ Bauchi steeti aka na ntị maka ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisi ụloọmeiwu steeti ahụ. Adams Oshiomole sị na aka gọvanọ Bala Mohammed, bu onye PDP, dị na emume mere eji nwee ndịisi Ụlọomeiwu abụọ na steeti ahụ. Ndị Omeiwu iri na otu nke mmadụ asatọ n'ime ha bụ ndị PDP gara n'azụ ndị otu ha iri abụọ ọzọ ga họpụta Abubakar Suleiman ka onyeisi. MMadụ iri abụo ndị ọzọ ahụ mechara họpụta onye bụbụ onyeisi Ụlọomeiwu steeti ahụ n'ọchịchị gara aga bụ Kawuwa Damina dị onyeisi nke ha. N'Ofesi, Boris Johnson sobụ na ndị chọrọ ka Briten si Yurope pụọ Ndị uweojii wuchiri be Boris Johnson bu otu n'ime mmadụ abụọ nwereike pụta dịka Prim Minister mba Briten. Ndị uweojii si na ha gara ebe ahụ dịka ndị agbatobi Maazi Johnson kpọrọ ha na ha na-anụ kepu kepu esomokwu n'ime ụlọ ahụ. Uweojii si na onweghi ihe ha hụrụ na-eme ebe ahụ. Samuel Kalu ga-adị mma - Dọkịnta Samuel Kalu nọ n'etiti Onye Egwu Super Eagles Samuel Kalu dara n'ama egwuregwu n'Ijipt ụnyaahụ, mana ndị dọkinta sị ka obi daa ndị mmadụ juu na ọ ga-agbake. Ihe mere dịka Naịjirịa na-ahazi izute Burundi taa na mmalite njem n'Iko Mba Afịrịka nke 2019. Unyaahụ Ijipt ji otu ọkpụ ha gbara Zimbabwe mepe ụzọ asọmpị ahụ" afirika-49572220,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49572220,Anambra road accident: Etu ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ isii n'Anambra si mee,"Ndị uweojii Anambara steeti na-ekwu na ọ bụ mmadụ isii bụ ihe nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na nso ọdọmmiri Agụlụ, dị n'Agụlụ, Anambara steeti ahụ, ebe mmadụ ise merụrụ ahụ.","Foto ihe mberede meburu n'Anambra na nso nso. Nke a mere dịka ngwongworo na ụgbọala atọ gụnyere ụgbọala L300 Mitsubishi, ụgbọala Toyota sienna na ụgbọala Toyota camry, sukọtara ọnụ. E bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ St. Joseph dị n'Adazi, ebe ha na-anata nleta ọgwụgwọ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị steeti ahụ na onye Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ John B.Abang, agaala ebe ihe mere. Obiano nọ ebe ahụ kwe nkwa na ọ ga-eji aka ya akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị merụrụ ahụ." afirika-45218126,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45218126,Ụkọ mmanụ n'Anambara: Ndị na-ere mmanụ ụgbọala akwụsịla abụbọọrụ,Nke a na-eme dịka otu jịkọtara ndị na-azụ ma na-ere mmanu ụgbọala a kpọrọ 'Independent Petroluem Marketers Association of Nigeria(IPMAN) )' ngalaba nke Anambara steeti na gọọmentị steeti ahụ nwechara ọgbakọ ụbọchị Toọsde.,"Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mmiri na ihe eji enyere ndụ aka bụ Obi Nwankwo gwara ndị ntaakụkọ na ha ""ekpeziela dịka ha kwekọrịtara ihiwe kọmịtị ga-eleba anya n'okwu ego iti aka n'obi na ihigharị ọdọmmanụ abụọ bụ isi sekpụ ntị na abụb ọrụ ahụ."" Ndị otu IPMAN jụburu iresị ndị ọkwọ ụgbọala mmanụ nke mere e ji nwee ụkọ mmanụ na steeti ahụ abalị ole na ole gara aga. Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ndị otu ha a kuturu ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ha ego iti aka n'obi dịka ha si kwe na nkwa. Abụbọọrụ ha mere ọtụtụ ndị ji ịkwọ ụgbọala akpa ego ji busa ụgbọala ha, ma meekwa ndị mmadụ were ụkwụ na-aga ogologo njem ịga ọrụ maọbụ ahịa ka ha aghara ịnọrọ n'ụlọ. Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụọnụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya, kwuru na ya bụ nsogbu metụtara ya na ndị be ya maka na ha ahụghị mmanụ ụgboala ha ga-eji mụnye igwe na-enye ọkụ. O kwuru na ha ga-aga n'Asaba gaa gbata mmanụ ụgbọala ha ga-eji mee ihe. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45150729,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45150729,Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Ama m na ndị Igbo agaghị akwado m ma m zọọ onyeisiala na 2023 - Rochas,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Rochas ọ chọrọ ịzọ onyeisiala? Gọvanọ ndị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ ya kacha nwee ohere ịbụ onye Igbo mbụ ga-abụ onyeisiala Naịjirịa ma ọ zọọ na 2023. Mana o kwuru na ọ ma na Ndigbo agaghị ekwe akwado ya, ma kwuo na nkwado ya ga-esi n'aka ndị si mpaghara ndị ọzọ. O kwukwara na enweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị Igbo ọzọ a ma etu e si mara ya na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ. Rochas kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ n'ụlọọrụ ya n'Owere nso nso a. Ebe ọzọ na Naịjirịa: Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onitsha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018 Naijiria eturula ugo dịka ọkaibe n'ụwa niile n'asompi Technụzụ e mere na mba Amerika ụnyaahụ. Ụmụada ise si ụlọakwụkwọ Regina Pacie dị na Ọnicha, nọchitere Naijiria ji technuzu a kpọrọ, 'FD Detector,' ha mepụtara iji buso nsogbu ọgwụ adigboroja ọgụ n'ala Naijiria, were turu ugo dịka ọkaibe n' asompi Technovation. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ụmụaka Igbo eturula ugo ọkaibe na technụzụ na mbaụwa Mba Ofesi: Ndị uweojii na mpaghara obodo Fredericton dị na mba Canada, anwụchiela otu onye gbagburu mmadụ anọ gụnyere ndị uweojii abụọ. Ha ka na-enyocha ihe butere ịgba egbe a. N'egwuregwu, FIFA amachiela Kalusha Bwalya bụbu onye nchịkọta nakwa ọgba bọọlụ otu egwuregwu Zambia, afọ abụọ. Ha machiri ya ka ha nyochapụtara na ya na Mohammed Bin Hammam bụ onye Qatar FIFA machiri ndụ ebighịebi mere nrụrụaka. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ị hụla nwaanyị Igbo a na-eji ịnya ụgbọala akpa ego? Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego" 44717826,https://www.bbc.com/igbo/44717826,"Akụkọ kachasị na'abali a: 'Oke idemmiri na-abịa, kee nkwụcha - NEMA","'Oke ide mmiri, ke nkwụcha' - NEMA","Onyeisi ndị ụlọọrụ otu gbatagbata nke a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' na bekee nke mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Walson Ibarakumo adọọla aka na nti ka ndị bị na mpaghara ahụ kee nkwucha maka na oke ide mmiri na-abịa. N'akụkọ nyiri ibe ya, otu a kpọrọ Igbo Environmental Foundation ekwuola na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nwere mbize karịrị puku abụọ na narị asatọ nke nwere ike ịchụsa obodo dị iche iche na mpaghara ahụ. Ha ga-achụda Buhari n'ọkwa? Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo enyela ụlọomeiwu iwu ka ha bido ozugbo ozugbo usoro ịchụda Muhammadụ Buhari n'ọkwa onyeisiala nke a kpọrọ 'impeachment na bekee. Oke ogbugbu mmadụ ga-emebiri Buhari ntụliaka 2019 - Ndị Bishop Katọlịk Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlịk na Naịjirịa a kpọrọ, 'Catholic Bishops Conference of Nigeria (CBCN),' ekwuola na nkiti onyeisiala bụ Muhammadu Buhari gbara maka oke ogbugbu ga-emebiri ya ihe na ntụliaka na-abịanụ. Ndị Nigerianlivesmatter emeela ngagharịiwe n'Abuja Ndị Katọlik mere ngaghariwe megide oke ogbugbu mmadụ na Legos na nsonso Ụmụafọ Naijiria na ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye pụtara n'igwe na Unity Fountain dị n' Abuja mee ngagharíiwe iji igosi iwe ha banyere oke ogbugbu mmadụ na-eme n'akụkụ Naijiria dị iche iche. Sarakị chọrọ ka ụlọomeiwu steeti 36 kwado uweojii steeti Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki arịọla ndị ụlọomeiwu nọ na steeti iri ató na isii na Naijria ka ha tinyere aka na ndezigharị iwu ala Naijiria ka e nwe ndịụwe ojii nke steeti. Emmanuel Macron enyeela Afirika ndụmọọdụ Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron biara njem na Naịjirịa ugbua, na-ekwusi ike na ụlọọrụ otu EU ga-emepe na Afríka maka ndị mbiambia ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na gọọmentị ndí mba nó n' Afríka tinye aka na ya bụ ọrụ. Onweghị ihe gbasara anyị na Kylain Mbappe Otu Real Madrid ekwuola na akụkọ kwuru na ha ga-azụ ọgba bọọlụ Kylain Mbappe abụghị ezi okwu ncha ncha. Gee akụkọ anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị 'Ekwere m na 'One Nigeria' ma ụmụ Igbo gaanụ mepe ala Igbo'" 42971169,https://www.bbc.com/igbo/42971169,Buhari akpọghachiela onyeisi NHIS a na enyo enyo,Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari akpọgzhachiela onyeisi ụlọ ọrụ na ahụ maka ahụike nke a na-akpọ National Health Insurance Scheme (NHIS) bụ Usman Yusuf.,"Minsita ahụike sị na a sị ya na Yusuf Usman rụkọwa ọrụ nke ọma Minista ahụike bụ Isaac Adewole nyere Yusuf ezumike ọrụ na onwa Jun nke afọ 2017 ka a na atụ aka na Yusuf tinyere aka na mpụ. Otu nyocha Minista ahuike họpụtara mechara si na Yusuf mere mpụ gbasara izu ego ohanama nakwa ime ịma mmadụ banyere ọrụ ya. Ụlọ nta akụkọ Premium Times na akọwa na Buhari eleteghị anya na akwụkwọ otu nyocha a mepụtara tupu o kpọhachịe Yusuf. Ụlọ nta akụkọ ahu na ekwukwa na ọ na mgbede ụnyahụ ka ezịgara Adewole akwụkwọ mkpọhachị Yusuf. Akwụkwọ mkpọhachi a siri Adewole ya soro Yusuf rụkọ ọrụ ma o laghachite. Anyi ga esoro akụkọ a taa, ma wetekwara ụnụ etu o siri kwụrụ." afirika-44517202,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44517202,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị agha mmiri jidere ahịa iwu osikapa na-abata Naịjirịa,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Anwụchiela mmadụ maka ọgbugbu eze ndị Ọgbọzinne Ndị uweojii n'Enugwu anwụchiela onye e kwuru gburu eze ndị Ọgbọzinne dị na Nkanu na steeti ahụ. Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed kwuru na a nwụchiri nwoke ahụ bụ Chibuike Odoh onye Mgbuji n'Ehamufu site na nchọpụta ndị uweojii n'otu nchekwa ndị ọzọ. Naịjirịa Mmadụ ole chọrọ oche onyeisiala? PDP chịrị Naịjirịa afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị Ntuliaka 2019 na ha ebiri ọkụ nwayọ nwayọ dịka otu onye ọzọ kwupụtakwara ebumnobi nke ya ịzọ ọkwa onyeisiala. Onye a bụ onye chịburu Kaduna steeti bụ Ahmed Makarfi. Ebe ọzọ na Naịjirịa Osikapa bụkwa ahịa iwu Osikapa bụ nri a na-erikari n'ezinaụlọ niile na Naịjirịa Ndị agha mmiri Naịjirịa kwuru na ha jidere ụgbọ mmiri na-ebubata ihe ruru akpa osikapa ruru puku abụọ site na mba Kamerun. Cheta na gọọmenti machiri mbụbata osikapa na Naịjirịa iji nye aka kwalite ọrụ ugbo ịkọ osikapa na Naịjirịa.enug Akụkọ mba ofesi Ụmụnwaanyị anabataghị ụfọdụ atụmatụ Trump gụnyere nwunye ya. Foto ụmụaka anapụrụ nne ha dịka ha na-achọ ịgafe oke ala Mexico na Amerịka Nwunye onye chịburu mba Amerịka bụ Laura Bush ekwuola okwu megide ọchịchị Trump maka atụmatụ ya gbasara ndị mbịambịa. Nwaanyị Bush kwuru na atụmatụ ahụ na-etisa ụmụaka na nne dịka nwunye Trump kwukwara ka di ya jiri obi ya na-achị. N'egwuregwu, Asọmpi Iko Mbaụwa na-ebiri ọkụ. Dịka asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu, mba England ga-ezute Tunisia na mgbede taa n'otu nke G. Brazil na Swizaland ji otu ọkpu goolu gbaa onwe ha onye laba onye laba ụnyaahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Gwa anyị ihe puru iche iji echeta nna gị?" egwuregwu-47871373,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47871373,Champions League: Kedụ ndị obi ha ko n'elu ugbua?,Ụnụ adịkwa njikere maka asọmpị egwuregwu bọọlụ Champions League nke mgbede a?,"Cheta na ọ bụ Liverpool na Porto ga-achịpụ ya ebe Man City na TottenHam ga-esukọ mpi n'otu oge ahụ bụ elekere asatọ nke mgbede ụbọchị April itoolu. End of Twitter post, 1 Ndị otu egwuregwu Mancity depụtara na twitter ha etu ha si hazi onwe ha maka asọmpị mgbede a. Soro anyị ka ịmara etu ya bụ asọmpị ga-esi ga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44639517,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44639517,Ndị Biafra Zionists: 'Ikpe ha dịzị n'aka ọkaiwu nke steeti',"Ndị uweojii Enugwu steeti agọpụla aka na ukwu ha n'okwu gbasara onyeisi otu Biafra Zionist Federation bụ Ben Onwuka, onye ha nwụchiri ya na mmadụ 20 ndị ọzọ maka ịga konye ọkọrọtọ(flag) Biafra n'obi Gọọment Enugwu steeti iji mee emume Ncheta Biafra n'ubọchị Mee 30.","Ndị Biafran Zionists so na ndị chọrọ Biafra nke ọhụ Ndị otu Biafra Zionists Federation, bụ otu n'ime otu na-achọ ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa mere ngagharị iwe na gbụrụgbụrụ ụlọikpe dị n'Enugwu ụnyaahụ bụ Wenesde maka na ndị uweojii akpọpụtaghị onyeisi ha bụ Benjamin Onwuka n'ụlọikpe. Mana na mkparitaụka BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu nwere, o kwuru na ""Aka ndị uwe ojii adịghịzị na ikpe ha kama ọ dị n'aka ọkaiwu nke Enugwu steeti(Attorney-General). Ndị uweojii nwụchịkọrọ Onwuka na mmadụ 20 ndị ọzọ ka ha na-achọ iwakpo obi gọọmentị nke Enugwu. Uweojii kwuru na mkpebi ndị a gara obi gọọmentị a bu ka ha konye ọkọrọtọ Biafra n'ebe ahụ iji me emume ""ncheta Biafra"". Ka anwụchịkọrọ Onwuka na ndị otu ya, ndị uweojii kpụpụrụ ha ụlọikpe Enugwu East ka ha ga zara ọnụ ha. Onwuka na ndi ọzọ gọrọ ebubo a eboro ha, mana, ka abịara ụlọ ikpe ahụ na Wenesde ha anọghị n'ụlọ ikpe. Ọnọdụ a were ndị nkwado Onwuka na ndi otu ya bịara igere ikpe ahụ iwe kpatara ha jiri malite ngagharị iwe. Onye bụ osote onyeisi ndị Biafran Zionist Movement bụ Ambrose Ugwu, gwara ndi ntaakụkọ na uche ha bu na ọkaikpe ga atọghapụ ndị otu ha mana nke ahu emeghi. Ọ gara n'ihu jụọ ""ihe ndị mere ejiri kpọsa ha na mkpọrọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" 53274805,https://www.bbc.com/igbo/53274805,"Oji River Killing: ""Gọomentị rụọ ọrụ nchekwa dịịrị ha"" - Toby Okechukwu","Onye nnọchiteanya Engwu West Federal Constituency, Toby Okechukwu, e wegala ọnwụ Eugene Iloabani n'ụlọikpe nta, dị n'Abuja.","Okechukwu kpọrọ oku ka gọọmenti gbaa mbọ kwụsị oke ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa, ọkachasị n'alaigbo. Okechukwu sị na ndị uweojii jidere otu onye n'ime ndị kpara arụ ahụ bụ onye abụghị onye Igbo. O kwuru na ọ dị mkpa na gọọmentị jisiri ike rụọ ọrụ ha site na-ichekwa ndụ na ngwongwo ndị mmadụ karịa ịhapụ ndị ọzọ ka ha na-egbu ibe ha. Okechukwu sị na ọ ka mma na gọọmentị hapụrụ ndị mmadụ chekwawa onye ha maọbụrụ na ha agaghị arụlị ọrụ ahụ. Ọ sị na ""gọọmentị na-enweghị ike ịchekwa ndị ọ na-achị abụghị ezigbo gọọmenti""." afirika-46054510,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46054510,Akụkọ dị mkpa taa: Onye ga-azọta ọkọlọtọ APC n'Imo taa?,Akụkọ ndị dị mkpa taa,"Esemokwu dị n'otu APC n'Imo steeti eyirila trọuza dịka Okorocha na-aba mba. Aka na-achị Imo steeti agwaala onyeisi otu APC bụ Adams Oshionhole ya rituo n'ọkwa maka mbọ ọ na-agba ị kewa APC. Ọ na-abịa dịka taa bụ ụbọchị ịkpeazụ tupu INEC akpọpụta aha onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ na Naịjirịa niile. Ọzọ, Otu ọkaiwu bụ Isaiah Ayụgụ arịọla ụlọịkpe dị n'Abuja ha mee ka Femi Fani Kayode nakwa Enyinnaya Abaribe bịa zara ọnụ ha maka ọsọ Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa. O kwukwara ka anwụchie ndị niile katọrọ ndịagha Naịjirịa ma boo ha ebubo ntọrọ Kanu gụnyere onye ọkwaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor. Na mba ofesi Mba Zimbabwe ga-ebido ị mịpụta mmanụ agbịdị n'ala ha dịka achọpụtara na enwereike ịnwe ya bụ mmanụ n'ala ha. Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwagwa zipụrụ ya bụ ozi ma kwukwa na ọrụ ga-ebido n'afọ abụọ na-abịa. N'egwuregwu, Ndị Mamelodi Sundowns nabatara Usain Bolt ọfụma Dịke n'ịgba ọsọ bụ Usain Bolt apụọla n'otu egwuregwu bọọlụ Mariners nke mba Ọstralia. O kelere ndị isi otu bọọlụ ahụ ebe ọ nọ anata nkuzi kmegbe ọnwa ọgọst. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44409687,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44409687,Ụgbọelu osote onyeisiala enweela nsogbu n'elu,Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gbanahụrụ ọdachị ụnyaahu ka ụgbọelu bu ya ga-ụlọakwụkọ akpọrọ Nigerian Customs Command and Staff College nke dị na Gwagwalada nwere nsogbu n'elu.,"Osinbajo jiri ụgbọala laa ka ọ kagburu njem ya. Ụgbọelu a, bụ nke a na-akpọ ""helicopter"" ebuchịghị ya azụ n'Abuja. Osinbajo gara ụlọakwụkwọ Customs ahụ bụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ngalaba na hụ maka ụtụisi na ngwa ahịa na-abata Naịjirịa. Osinbajo na ndị pụtara na-agụmakwụkwọ sere foto tupu ọ gawa ebe ụgbọelu ya dị, mana ka ụgbọelu ahu fepụrụ, achọpụtara na-ụme adịghịzị ya ị naru. Osote onyeisiala mechara jiri ụgbọala lawa, ka ahapuru ụgbọelu ahu ebe ahụ. Onye mgbasa ozi Osinbajo bụ Laolu Akande kwuru na ọ bu ihe mebiri na ya bụ ụgbọelu mere osote onyeisiala jiri hapụ iji ụgbọelu ya la. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45541162,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45541162,Anambra: Aka ndị uweojii akpara nwaanyị rere nwa ya,"Na mgbede ụnyaahụ ka aka ndị uweojii n'Anambara steeti kpaara Oluchi Mba (28) bụ onye ha kwuru rere nwa ya ọ mụrụ mkpụrụ ụbọchị asaa gara aga n'Ogidi, Anambara steeti.","Itu mgbere ụmụaka bụ ihe na-ewu ewu ugbua na Naịjirịa Oluchi bụ Onye Ikenga Ogidi hiri asaa nabọ resị Edith Obiakor (55) nwa n'ọnụ puku narị naịra atọ na iri ise (350,000.00) ma tụọ ụgha na ya bụ afọime pụrụ apụ. Edith regherịrị ya bụ nwa resi ya ọgọ ya nwoke bụ Vitus Aniụno (50) bi na Fegge, Onisha. Edith n'onwe ya bụ nke a matara ka onye na-atụ mgbere mmadụ bikwanụ na Nkpọ, Anambara steeti. Vitus gopuru Edith ya bụ nwa n'ọnụ puku narị naịra isii na iri ise (650,000.00). Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed sị kwuo, ""ndị niile a asaalarị asịsa gbasara ajọ agwa ha kpara ebe a napụtagoro ha nwa ahụ"". A ga-akpụpụ ha ụlọikpe mgbe adịghị anya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47830557,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47830557,"Nigeria 's debt profile: Ibite ego abụghị ihe ọjọọ, kama...' Ọkachamara","Dịka okwu na-arị ibe ya elu gbasara ego Naịjirịa ji n'ụgwọ dịka ụlọọrụ Debt Management Office siri kwupụta, onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Bongo Adị, a kọwaala n'onweghi ihe dị njọ mmadụ maọbụ obodo ibite ego, kama na ọbụ ihe e jiri ya mee.","EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị Na mkparịtaụta ya na BBC Igbo nwere, Adị kọwara ya dịka ihe mwute na ọchịchị gọọmentị dị icheiche na-ebite ego n'ebughi ụzọ mara ihe ha ga-eji ya mee, iji nyere ndụ ndị ha na-achị aka. Ọ katọrọ atụmatụ ibiri ego na-etinyeghi ya n'ihe ga-eme ka ọmụbanye nakwa ikesara ndị mmadụ ego na-ahịa n'ụzọ i nyere ha aka dịka nke na-ekwesighi ekwesi. O kwuru: ''I bite ego abụghị ihe ọjọọ, kama ọ bụ ebumnobi anyị. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị were ya nyere obodo anyị aka, ma kwalite ọnọdụ obibi ndụ ndị mmadụ''. Adi, kwupụtara na ọbụrụ na e kesaa ego a dịka ọnụọgụgụ mmadụ nọ na Naijiria siri dị, na onye ọbụla nwere ike iketa ego buru ibu. N'ihe Naịjirịa ga-eme wee kwụọ ụgwọ a, Adị tụpụtara na ọ bụrụ na Naịjirịa e nwee ndị ndu isi jụrụ oyi, ma bụrụkwa ndị ga-eleba anya n'ịkwalite akụrụngwa eji e nyere ndụ aka, ha ga-akwụpụcha ụgwọ a. Ọ kwara arịrị na mbọ onye bụbu Mịnịsta Naịjirịa na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala, iji hụ na mba ndị ọzọ kachapụrụ ego Naịjirịa ji a bụrụla nke kụrụ afọ n'ala n'ihi akatamkpo ego Naịjirịa ji ugbu a. Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ụgwọ bụ Debt Management Office, nọọrọ n'abalị anọ ọnwa Eprel kwupụta na Naịjirịa ka ọ dị ugbua ji ụgwọ ego ruru Tarị naịra iri na abụọ na ụma atọ (N24.387trillion). Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu na soshial media Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ụgwọ Naijiria. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47787160,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47787160,LGBT: A ga-akụgbu nwoke na-edina ibe ya na nwaanyị na-edina ibe ya n'okwute,Akụkọ kacha dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Mba Brunei ga-egbu ndị na-akwaso onwe ha iko. Nke a bụ iwu ọhụrụ islam nke mba Brunei nyere iji belata nwoke idina ibe ya nakwa nwaanyị idina ibe ya na mba ahụ. Iwu ọhụrụ a bụ Sultan Hassanal Bolkiah nke mba Brunei tinyere ga-amalite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Epụrelụ 2019 ga-emetụta mpụ ndị ọzọ. Iwu a kwuru na a ga-eji okwute kugbuo nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-akwaso onwe ha iko. Mana ọtụtụ mba ndị ọzọ n'ụwa akatọọla iwu a. Emeka Ihedioha a họrọla ndị ga-eso na 'Transition Committee' ya Ihedioha họpụtara mmadụ narị iri atọ na atọ (bụ 133) nke ndị so n'ime ha bụcha ndị ọgaranya dị icheiche n'obodo makwa ndị na-arụrụ onwe ha. Ọ gwara ọha gara echichi kọmiti ya na ""Anyị ga-agbambọ inwete nkwenye ndị Imo, ka Chineke na-enyere anyị aka, aka anyị ga-akwụrụ ọtọ n'ihu na anyị kwalitere iwu ziriezi na mmejupụta ndọrọndọrọ ọchịchị anyị."" O kwukwara na ọrụ mwulite obodo Imo n'oge a siri ike ma dịkwa ukwu mana o kwenyere na ndị Imo ga-enye ya aka. Ọ bụ kọmiti a ga-ahụ na ihe gara sịrịrị werere na echichi ya dịka Gọvanọ Imo n'ụbọchị Mee 29, 2019. Anwụchiela ndị na-eme ọgwụike n'Enugwu Calista Udomma Meka bụ ọnụ na-ekwuru NDLEA, ụlọọrụ na-ahụ maka ọgwụike n'Enugwu a kọwala etu ha ji nwụchie ndị ji ọgwụike agbarụ mmiri Na Trans-Ekulu. Ọkaikpe Walter Onnoghen Okaikpe Ukwu Naịjirịa enyere ezumike bụ Walter Onnoghen azachala ọnụ ya n'ikpe a na-ekpe makana ebubo na okwughi akụnaụba ya n'ụlọikpe ""Code of Conduct"". Ọkwaiwu Onnoghen bụ Adegboyega Awomolo kwuburu na ya ga-akpọ ""aka ebe ato"", mana ọ bụ sọsọ otu onye ka ha kpọrọ ụbọchị mbu nkle ọnwa Epurel Monday. N'ụbọchị ahụ, ndị ọkaiwu Onnoghen rịọrọ CCT ka agbọta Theresa Nwafor bụ onye ọrụ CCT ka ọ bịa gbara ha akaebe. Ọ bụ otu onye n'ime ndị ọkaiwu Onnoghen bụ Chris Uche mechiri ịzara ọnụ ya. Ọ sị: ""Anyị enyochara akaebe ndị na-ebo ebubo wetere, nke mere anyị ji kpebie ịwụsa okwu anyị."" A ga-ekwu mgbe a ga-ekpebi okwu n'ihu. Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchịehi Ntọrị mmadụ n'ụzọ Kaduna na Abuja ka na-ewukwa Agbanyeghị na ụfọdụ na-ekwu na ndị mmadụ ndị ntọrị nwụchikọrọ n'ụzọ si Kaduna gawa Abuja n'ụbọchị Mọnde ruru iri atọ na asaa, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna bụ Yakubu Sabo sị na ọnụọgụgụ ahụ bụ asị ọcha. Mana o kwetere na ha amaghị mmadụ ole aka ji, dịka ọ bụ otu ụgbọala danyere n'aka ndi ntọ a. Nwaanyị dị afọ iri asaa na asaa so ndị gụchara mahadum na Legọs Otu nwaanyị dị afọ iri asaa na asaa esorola ndị natara asambodo ""Guidance and Counselling"" na Mahadum Legos. Nwaanyị a kpara ike a sị na ọ laala ezumike nka, mana ya achọghị ịnọ nkịtị. N'ofesi, Ndị uweojii na mba Amerịka anwụchiela Eric Holder bụ onye a na-enyo na aka ya dị n'ogbugbu onye mbem aha ya bụ Nipsey Hussle. Cheta na agbakanyere Hussle egbe n'ihu ụlọahịa ya. N'egwuregwu, Mmeri Wolves meriri Man Utd emeela ka ha na Tottenham jiri pọịntị iri isii na otu hara n'ogogo Tebulu Premier League. Isi Man Utd apụtaghị dịka Wolves ji ọkpụ abụọ asatara otu merie ha nke ugboro abụọ n'ime izu atọ. Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-55345394,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55345394,O nweghị ntuliaka ABSIEC mere na Bende - Onyeomeiwu na-anọchịte Bende-North,"Onye omeiwu n'anọchịte Bende North n'ụlọomeiwu Abia steeti bụ Chijioke Chukwu, akpọọla oku ka onyeisioche ngalaba na-ahasị ntuliaka na steeti ahụ bụ Mkpa Agu Mkpa kagbuo ntuliaka e mere na Bende taa bụ Fraide. Chukwu katọrọ ka ntuliaka okpuru ọchịchị siri gaa na Bende, kwuru na ahụghị ndị ọrụ ABSIEC na ndị ọrụ ngo ha na ọnọdụ ntuliaka nile dị na Bende.","Ọ katọrọ onyeisioche ABSIEC sị na 'onye ọbụla ma na ọgaghị ahazili ntuliaka n'ụzọ kwesịrị ekwesị n'Abịa."" Ndí uweojii nó órú nchekwa na ntulaika Abía Steeti Ndị Abia steeti na-eme ntuliaka ịhọpụta ndị ga-achị okpuruọchịchị obodo Ntuliaka amalitela n'Oram/Okwura Ward (13) Ohiya Umuahia South Ntuliaka ochichi okpuruọchịchị obodo n'Abia steeti na-aga n'ihu taa bụ Fraịde. Mgbe onye ntaakuko BBC Igbo rutere isi ochichi nke Umuahia North ebe esi egburu ngwa oru maka ntuliaka nke taa, ndị ọrụ ntuliaka Abia steeti a kpọrọ 'Abia State Independent Electoral Commisson' (ABSIEC) n'ịchafụ nakwa ndị otu pati dị iche iche nọkwa na njikere iburu ihe ọrụ ndị ahụ gawa na ebe a ga-eji ha rụọ ọrụ. Uche ọtụtụ mmadụ adịgha na ntuliaka a Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt Amalitebeghi ikesa ihe ọrụ ntuliaka ndị a na mgbe oji okara gafee ekekere asatọ nke ụtụtụ, n'isi ọchịchị obodo Umuahia na ndị ọzọ. Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt Ndị jere ibute akụrụmgwa eji atụ vootu n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt Anyị na-achọpụta na mgbe ọfọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ ngwongwo eji eme ntuliaka erutebeghị Abia North na Abia South agbanyeghị na ọkammụta Mkpa Agu Mkpa bụ onyeisi ụlọọrụ ntuliaka Abịa steeti akpọrọ Abia State Independent Electoral Commission (ABSIEC) na-agwa ndị ntaakụkọ na ngwongwo ndị ahụ ahapụlarị isiụlọọrụ ha gawa ama 292 niile dị na steeti ahụ. Onye ntaakụkọ BBC nọ Umuahia na-ekwu na ndị na-azụ ahịa na-azụrụ onwe ha ahịa ha n'agbanyeghi na ntuliaka Okpuru Ọchịchị ime obodo a na-aga n'ihu." afirika-47758304,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47758304,Ancient wars: Lee agha Igbo kpara ike na ya oge ochie,Igbo nwere ọtụtụ akụkọ dị omimi anaghị echefu echefu mere na Ndigbo bụ ndị puru iche.,"N'ime ihe nkiri a, anyị na-echeta agha dị ukwu Igbo lụrụ mgbe gboo. Ha lụrụ agha a tụpụ ndị Briten jikọtara ala Naịjirịa nke ndị Bekee kpọrọ Colonialism. Igbo busoro ndị Briten na ala ndị ọzọ agha n'ihi na ha chọrọ ịnapụrụ ha ikike ịchị onwe ha. Chọpụta etu agha siri gaa n'ime ihe nkiri anyị.Ihe nkiri na-egosi agha Igbo na ndị agbataobi lụgara oge ochie na ka agha ndị siri metụta ha: Igbu ichi, njimara ndị Umudioka" afirika-45281027,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45281027,Miyetti Allah: Ihe mere ha ji bụrụ okwu akpụ n'ọnụ na soshal midia,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Ihe Miyetti Allah ji ewu na soshal midia Otu Miyetti Allah akpala agụ aka n'ọdụ. Ụmụ Naijiria na-ewere ha iwe maka okwu otu onyeisi ha na Benue steeti bụ Alhaji Garus Galolo kwuru ebe ọ kpọrọ oku ka Bukola Saraki tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onyeisi ụlọomeiwu ma ọ bụghị otu ahụ, ha amanye ya ka ọ hapụ ọkwa ya dịka onyeisiala. Otu PDP site n'ọụ ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kola Ologbondiyan katọrọ okwu ahụ ma kpọọ Onyeisiala Buhari oku ka ọ nwuchie ndị ndu otu Miyetti Allah, ma ha ikpe maka 'atụmatụ Igbo Ekulie kpọrọ oku ka gọọmenti hapụ ụmụnwaanyi a Ụmụnwaanyị Biafra n'emume ncheta ụbọchị Biafra Ọgbakọ ụmụafọ Igbo maara nke ekwe na akụ na ọrụ bụ Igbo Ekunie Initiative agbarụọla ihu kpọọ oku ka ndị uweojii tọhapụ ụmụnwaanyị Igbo ruru otu narị ha ji eji. Ndị uweojii kpọchiri ụmụnwaanyị a maka na ha mere ngagharịiwe ka gọmentị etiti tọhapụ Nnamdị Kanu bụ onye ndụ Ipob ejieji kemgbe afọ gara aga. Ekweremadu akpọọla oku ọzọ maka ọchịchị onyeisiala Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ Osote onyeisi ụlọomeiwu Sineti bú Ike Ekweremadụ akpọọla oku ọzọ ka ọnọdụ onyeisiala na nke ndị gọvanọ bụrụ otu ugboro afọ isi. Ekweremadụ, bụ onye na arụ ndị ọrụ gọọmenti etiti aka maka ọgbaghara dị ,tụrụ ariri maka tigbuo zogbuo di na ndorondoro ọchịchị ugbua ebe ejighizi ezi ọchịchị kpọrọ ihe maka ntụlịaka 2019 na abịanu. Na mba ofesi, Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ofesi, Mba Amerịka amanyela ego ruru ijeri dola iri na isii na ngwahịa si China. Ngwahịa ndị a gunyere kemical, plastik nakwa ọgbatumtum. China ekwuola na-ga ga-emekgwara. N'egwuregwu, David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA. Messi bụ onye mbụ nyerela goolu karịrị iri atọ n'ime afọ asaa nke asọmpi La Liga. N'egwuruegwu, obi adịghị ndị na-agba bọólụ na Spain mma ebe ndị mkpokota ha bụ La Liga kwetere iburu asọmpi ha buga na mba Ameriika. Sergio Ramos na Sergio Busquets bụ ndị nọ na isi okwu a sị na aka ndị ọgbaa bọọlụ esoghị na ya bụ nkwekọrịta ma kwukwe na ha nwere ike ịgba abụbụ ọrụ maka ya. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke n'Enugwu steeti na ndị na-achị ehi na-ebi n'udo. 'Arịarịa ga-arụkarị China ma ha nwee ohere'" afirika-48865186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48865186,Ijegun fire disaster: Nnukwu ọkụ gbagbuola mmadụ abụọ ma erepịa ọdọahịa 15,Ngalaba na-ahụ maka ihe gbata gbata bụ nke Bekee kpọrọ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba mere na mpaghara Ijegun dị na Legọọs.,"Lagos fire: Ọkụ ọgbụgbọ ataala isi mmadụ abụọ na Legọs Ya bụ ọkụ bidoro mgbe ndị na-ezu ọhị mmaụ agbịdị gbapuru igwe mmanụ n'Ijegun. NEMA kwuru na mmadụ 12 merụrụ ahụ ebe ụgbọala 31 gbara ọkụ. Dịka NEMA si kwuo, eburula mmadụ anọ n'ime ha gawa ụlọọgwụ mahadụm Lagọs, ebe asatọ ndị ọzọ n'ụlọ ọgwụ Gbagada. Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri ọkụ na-ere ka ndị mmadụ na-agba ọsọ. Ụgbọala Victor Nwankwo gbara ọkụ n'ọkụ a Ndị be ebe ahụ gwara BBC na ọ bụ ndị bịara abịa kpara ike a ma kwukwa na ọbụghi mbụ ụdịrị ihe a na-eme. ""Ọkụ dị otu a gbakwara n'afọ 2008. Arịrịọ anyi bu ka gọọmentị bịa me ihe maka ihe a."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47326233,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47326233,Election 2019: Ndigbo ejikọla ọnụ katọọ iji ndị agha mee ntụliaka,"Ọtụtụ otu na-azọta maka ọdịmma ndị Igbo gụnyere Ohaneze, Alaigbo, Massob, Asetu na ndị ọzọ ekuniela na nzụkọ mberede ha nwere n'Enugwu were wepụta ọtụtụ nkwekọrịta nke gụnyere na Ndigbo ga-akwado onye kwere ha nkwa ighagharị ọchịchị Naịjiria.","Onye isi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo gụpụtara nkwekọrịta ahụ wee katọrọ ka gọọmentị siri kesaa ndị ọrụ agha n'ala Igbo maka ntuliaka wee yọọ Ndigbo ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla kama ha gaa binye aka n'akwụkwọ. Ndigbo gbakọrọ na nzuko ebe Nnia Nwodo gụpụtara nkwekọrịta ha nwere Ọkammụta prof. Ụzọdịmma Nwala bụkwa onyeisi Alaigbo development foundation kwuru na ndịgbo na-akwado Atiku na Obi n'ihi na ha ekwetala ịhazi ka obodo anyị siri dị, nke ga-enyere ndị igbo aka nke ukwuu. Sinetọ Ben Obi kwadoro ya bụ nkwekọrịta, gwara ndị igbo ka ha jisie ike were PVC ha chụpụ ọchịchị nọ ugbua were tinye nke Atiku na Obi dịka otu niile a jiri kwekọrịta. Chief Emmanuel Iwuanyanwu kwara arịrị na ndịgbo dịzị ka ha esoghị nwere obodo a were kwuo na ozuola. Otu Ohaneze, Alaigbo, Massob nakwa Asetu so na ndị bịara ọgbakọ ahụ. Onye nọchitere anya ndị massob bụ mazị Uchenna Madu kwuru na ihazighari obodo Naijiria dịka Atiku siri kweta bụ naani out n'ime ihe Massob na ndị zọ chọrọ, Ma kwuru na ha kwenyere ebe ndị Out Igbo niile gwara ha tinye aka. Otụtụ ndị e jiri mara Ndị igbo bịakwara ya bụ nzụkọ mberede." afirika-46394249,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46394249,'Nollywood laghachi n'asụsụ Igbo unu jiri malite' - Vicky Nwogu,Ọkacha n'ihe onyonyo a na-emezi na Nollywood ugbua bụ na Bekee ka a na-eme ya.,"Ọ bụ eziokwu na a ka na-eme n'asụsụ Igbo mana ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ndị na-emepụta ihe onyonyo n'asụsụ igbo anaghị etinyezi uchu ịgba mbọ hụ na ha mere ya nke ọma. N'ihe nkiri a, onye na-eme nkiri na Nollywood bụ Vicky Nwogu gwara BBC Igbo ihe ndị na-ewute ya gbasara ndị na-eji asụsụ Igbo eme nkiri na Nollywood. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55849306,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55849306,Japan 2021: 'O nweghi mgbe m ji rọọ nrọ ịbụ onye egwuregwu' - Lauritta Onye,Lauritta Onye bụ onye na-anọchị anya Naịjirịa n'egwuregwu ndị ike dị n'obi ekwuola etu o si bido ya bụ ihe.,"Ọ kọwara etu o si bịa Legọs ime ejije Nollywood, tupu mmadụ agwa ya maka isonye n'ihe egwuregwu. Ọ malitere ịnọchite Naịjiria n'asọmpi n'afọ 2008. Lauritta bụ akpụrụka n'ịtụ ""shotput"", ebe o riterela onwe ya na Naịjirịa ọlaedo abụọ nakwa ọlaọcha abụọ. A mụrụ Lauritta bụ nwaanyị Imo state bụ ""a kwaa a kwụrụ"" n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1984. Gere ọnụ okwu ya ebe a:" afirika-52909693,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52909693,"Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu",Ode akwụkwọ ama ama bụ Chinua Achebe kọwara ilu dịka mmanụ nri ndị Igbo ji eri okwu.,"Ọ dị mkpa ị mata mgbe maọbụ ọnọdụ ikwesiri itu ilu ọbụla ị na-atụ. Ọ gaghị adị mma ka iwere ilu gbasara izulite ụmụaka na-atụ ebe a na-ekwu maka mkpata na mmefu ego, maọbụ were nke e kwesiri ịtụ maka alum di nwunye na-atụ mgbe a na-ekwu maka odibo na onyeisi ya. Akukọ a ga-eme ka ị tụọ ilu n'ọnodụ ha dabara, nke a ga-ebutere gị ezigbo nkwanye ugwu, udo na ọganihu n'etiti ndị ndị ọyị, ikwu na ibe nakwa ụmụnna gị. Ọnọdụ ndị a gụnyere alum di na nwunye, mkpata na mmefu ego, mmekọrịta odibo na onyeisi ya, ọchịchị, agwa mmadụ, mkpachapụ anya, ọzụzụ ụmụaka, igba mbo, nsọpụrụ, nri na ụgani,wdgz. Mgwa bute oche ka anyị gosi gị ilu dị iche iche nakwa ọnodụ ndị a na-atụ ha. Agwa mmadụ Nwaanyị makarịa di ya n'uzọ, ihe chere di ya, ewere ya. Mpụtara: Onye ọmachancha akpachapụghị anya, ọ danye na nsogbu edowere onye ọzọ. Wepụ aka enwe n'ofe , tupu ọ ghọọ aka mmadụ. Mpụtara: Kwụsị ajọ agwa gị tupu ọ lapụta gị. Otu onye siere igwe mmadụ nri, ọha ga-ericha nri ahụ mana igwe mmadụ siere otu onye nri, ọ gaghị erichanwu ya. Mpụtara: Otu onye agaghị emeli ihe igwe mmadụ kwesiri ime. Otu aka rụta mmanụ, o jezuo ọha. Mpụtara: Otu onye agwa ya jọrọnjọ nwereike ịmetọsị agwa ndị ọzọ dị mma n'akụkụ ya. Onye kpatara nkụ ahụhụ si ngwere bịara ya ọrụ. Mpụtara: Onye kotere nsogbu, agbaala ọsọ ntaramahuhụ ga-eso ya. Igba mbọ Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ Mpụtara: Ọgba mbọ na-eri nnukwu uru Agadị anaghị aka nka n'egwu o ma-agba. Mmadụ anaghị aka nka n'ihe doro ya anya. Ikwo aka tiri ọkụkọ akị. Mpụtara: Igba mbọ n'efu Onye gba bọọlụ, ọ racha oroma. Naanị ọgba mbọ na-eri uru Onye buru chi ya uzo, o gbagbue onwe ya n'oso. Mpụtara: Ọ dịmma ikwanyere onye na-enyere gị aka ugwu tụmadị chi mere gị ihe ibụ. Nsopuru Ọkụkọ na-edowe ahụ na ara na-ayị ya ahụbeghị nkịta mmanya na-egbu. Mpụtara: Onye na-achọ ọnwụ hụ ibe ya , ndụ agụwa ya. Ojituru m n'ala, ji onwe ya. Mpụtara: Onye ji aghụgho eme ihe o kwesiri ime , na-egbu oge ya. Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri Mpụtara: Onye kpasoo mmadụ ibe ya agwa ọma, o nwetakwa agwa ọma. Ogologo abụghị na nwam etola. Mpụtara: Anaghị eji etu mmadụ si topu ogologo , a mara ma ọ ma ihe. Agwọ emeghị nke o jiri buru agwọ, ụmụaka a chiri ya hie nkụ. Mpụtara: Ọ na-adị mma ka mmadụ were ihe ọ ma eme wee tuo onụ Ọzuzụ ụmụaka Ọ bụghị ụbọchi nwata kwafuru mmanu ka a na-apịa ya ụtalị, kama ụbọchị ọ kwafuru mmanụ agbịdị. Mpụtara: Agwa ọjọ nwata kpara ugboro ugboro bụ ihe na-ebutere ya ntaramahụhụ. Okro anaghị akarị onye kụrụ ya. Mpụtara: Nwata anaghị akarị ntuziaka nne na nna ya. Nwata rie ihe ọ na-amụrụ anya, ụra atụọ ya. Mpụtara: Mmadụ mee ihe na-agụ ya, o zuo ike maọbụ afọ eju ya. Nwata kwụọ aka ya, o soro ndị okenye rie nri. Mpụtara: Nwata ma ihe ga-eso ndị okenye rịkọọ ma ṅụkọọ maọbụ onye ma ihe ga-abanyenwu ebe ọgbọ ya agaghị abanwu. A naghị eji ụtụtụ ama njọ ahia. Mpụtara: Ejighị mgbe nwata pere mpe, ama ma ọ ga-ama ihe maọbụ jide nnukwu ego. Alum di na nwunye Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu Ọgọ bịakarịa , e zie ya kpata nkụ Mpụtara: Ọgọ na-ejekarị be ọgọ ibe ya , ga-anata mkparị makana ahukarịala ya. Okokporo si na ahia ekwoghi ekwo o, umu ya ha di ole n'ahia? Mputara: Nwoke maọbụ nwaanyị tozuru alụm di na nwunye, mee ya ka ha wee mụta ụmụ. Nwanyi lelie di ya, ekwu akpo ya nku Nwaanyị na-akparị dị ya, ga-adabanye n'ụbiam na ahụhụ. Nwunye awo si na di atoka uto, ya jiri nuta nke ya kworo ya n'azu. Mpụtara: E ji ilu a ama ụmụnwaanyị njakiri ka ha wee hụkwuo di ha n'anya nke ukwuu.Agbogho hokaria di ya aluo eke mmuo Agbogho hokaria di ya aluo eke mmuo Mpụtara: O dịghị mma ka nwaagbọghọ ghọtee di aka. Mkpata na mmefu ego EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị A hụ ihe karịrị ubi, ere ọba ji Onye na-ebe akwa ego hụ ihe nwereike iwere ndụ ya maọbụ nke ezinụlọ ya, o bupute akụ na ụba niile o zoro ezo. O re-ere bụ Eze; O zu-azụ bụ ezeMmadụ: Ugwu kwesiri onye ọbụla. Ahịa ukwu amaghị na otu onye abiaghi.Mpụtara: Ma ị gosighị ihe ị ma eme , onye na-ama gị aka ga-apụta kụchapụ gị. Akwukwo juru n'ohia, ma a baa a choba okazi.Mpụtara: Onye biara izụ ahia nwere ebum n'obi ihe ọ chọrọ izu agbanyeghị na enwere ọtụtụ udiri ihe ahụ na-achaba ya anya. Mkpachapụ anya O nweghị ihe anya hụrụ gba obara. Mpụtara: O nweghị ihe mmadụ ga-ahụ n'ụwa kwuo na ọ hụtụbeghị ya mbụ. Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n'efu. Mpatara: Mmadụ anaghị ebe akwa maọburụ na onweghị Erekwala ọkụkọ nwere otu ọkpa n'akụkụ ebe ibi. Mpụtara: A ghọọla aghụghọ ebe ama gị ọfụma. Chụọ ewu ojii n'ehihie Mpụtara: Mmadụ mee ihe n'oge o kwesiri ime ihe ahụ. Otu mkpụrụ akwụ adịghị efu n'ọkụ.A na-aka akpachapụrụ ihe pere mpe anya ọfụma karịa mgbe o juru ebe niile. Ezinulo A na-esi n'ulọ mara mma pụọ ama Mpụtara: Ihe ọma ọbụla ị na-eme n'iro, malite n'ụlọ mewe ya. Ebe a na-adụ nwa nwere nne ọdụ, ka nwa na-enweghị nne na-amụta ihe. Mpụtara: Onye ma ihe, na-esi na nzoghie ụkwụ ndị ọzọ muta ihe. Nne ewu na-ata igụ, ụmụ ya a na-ele ya anya n'ọnụ. Mpụtara: Ihe ọbụla nne maọbụ nna na-eme, ha mara na ụmụ ha na-amụta n'aka ha. Nwata na-ata akara, na-ata ego ya. Mpụtara: Nwata na-eme isi ike, na-ebutere onwe ya nsogbu. Amamihe Onye na-agakarị njem na-aka okenye n'otu ebe ama ihe nke ukwuu. Mpụtara: Onye na-emekarị njem ga-amụta ọtụtụ ihe karịa okenye na-anokarị otu ebe. Agbụsị gbaa otule ọ mụrụ akọ Mpụtara: Ihe mee mmadụ mekwasa ya , ọ mụrụ akọ. A tuọrọ ọmara, ọ mara, a tuọrọ ofeke, o fenye isi n'ọhịa Mpụtara: Naanị onye nwere amamihe na-anara ndumọdụ mana onye nzuzu na-atacha ndụmọdụ, o zuzuru gawa. Ukpana ukpoko gburu bụ nti chiri ya. Mpụtara: Ị maracha ihe ikwesiri ime ma gị emeghị ya, onwe gị mejọrọ Onye mara asụ, sụọ n'odo. Ma ị maghị asụ, sụo n'ala. Mpụtara: Ihe ọbụla onye na-eme, ya mara eme ya ọfụma. Nri Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị Agadị wekọtacha ọkazị ma gbajie mgbọrọgwụ ya, agụ biara n'afo nke mbụ ga-abịakwa ọzọ. Mpụtara: Erichala ihe niile inwere taa, cheta na echi dị. O nweghị onye na-ajụ ofe azụ juputere na ya. Mpụtara: Ihe dị mma na-amasị onye ọbụla maọbụ onweghị onye na-ahụ uru jụ ya. Onye si na ya anaghi ata anu nkita, ya arakwala mmiri ofe ya. Mpụtara: Ihe ọbụla na-adịghị gị mma, a Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-46272848,https://www.bbc.com/igbo/media-46272848,Lee mkpamkpa ọkụ kpara n'ahịa Nkwo Ngwa Aba,"Ọkụ gbara ahịa Nkwọ Ngwa dị n'Aba, Abịa steeti lara ego ruru nde kwuru nde naira, ma gbarie ọdọahịa karịrị iri asaa (70).",Akụkọ kwuru na ọkụ ọgbụgba ahụ nke bụ igwe na-enye ọkụ bekee kpọrọ generator butere ya gbara ọgbọ osisi nakwa ebe a na-ere ihe e ji arụ ụlọ. Akụkọ ọzọ n'ekwukwa na ọkụ a sị na ọdụahịa otu nwaanyị na-esi nrị ahịa na-emenyụghị ọkụ ya nke ọma. Mbọ BBC gbara ịnwete ndị ọrụ na-emenyụ ọkụ bụ Abia Steeti Fire Service lara n'efu. Lee foto sị na ihe mberede ahụ: afirika-44972368,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44972368,Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?,Ịrụ ụka ka na-aga n'ihu maka oke ruru nwaanyị na be nna na ya nakwa be dị ya.,"Ebe ụfọdụ si na ụmụnwaanyị nwere ikike dị ebube n'ala Igbo, ndị ọzọ sị na agbaọhụrụ azapụchala oke ụmụnwaayị kpam kpam. Juliet Kaego na Ọzọ Mcginger Ibeneme tinyere ọnụ na ya bụ okwu ma gbaa ya n'anwụ ka ọ dị ụgbụa. Soro anyị lee ihe nkiri a." afirika-55124629,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55124629,Coronavirus in Africa: Ahụhụ anyị na-ata n'inyocha ndị mmadụ ahụ maka coronavirus,Ndị ọrụ ahụike na Saụt Afrịka akọwala ihe ha gabigara dịka ha na-agagharị inyocha ndị mmadụ ahụ maka ọrịa coronavirus.,"Otu n'ime bụ onye nọọsụ bụ Tshego Selona sị na tara ahụhụ dị iche iche n'oge nyocha a nke gụnyere ịgbahapụ ezinaụlọ ha, ibute coronavirus, ọnwụ na ihe ndị ọzọ. Ọ sị na ndị mmadụ na-asọ ha asọ maka na ha nwereike ibunye ha ọrịa coronavirus. Selona sị na ga anaghị ehi ụra ọfụma n'abalị dịka ha na-agba mbọ ịgazu mpaghara ime ime obodo Saụt Afrịka. O kwukwara na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike ibe ya nwụrụ n'ọrịa mana ọ gbakere na-agbanyeghi na o butere ọrịa a. Kirie ihe o kwuru n'uju:" 43042536,https://www.bbc.com/igbo/43042536,UEFA: Chekwa ugwu egwuregwu bọọlụ,UEFA agwala ndị ogbu bọọlụ ka ha kpuchie ndị na-agba bọọlụ maka ihe oke imerụ ahụ site n'ịta onye ọbụla mere ihe nwereike imerụ mmadụ ahụ.,"Uefa bụ otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba dịna Europe niile Ha kwuru nke a site n'ihe nrụtụaka onye nchịkọta bọọlụ ndị Manchester City bụ Pep Guardiola ka ndị na-egbu bọọlụ chịkọta ya nkeọma mgbe e merụrụ onye bọọlụ ya bụ Leroy Sane ahụ n'ọnwa Jenụwarị. UEFA gwara ndị ogbu bọọlụ na ha nwere ọrụ ichekwa ugwu egwuregwu bọọlụ. ""Anyị chọrọ ka ndị ọgba bọọlụ gbaa bọọlụ, ya mere a ga-echekwa ha nkeọma"" dịka onyisi ndị ogbu bọọlụ bụ Pierluigi Collina kwuru. ""Anyị achọghị i tinye ndụ onye bọọlụ ọbụla na nsogbu nihi mmerụ ahụ nke egwuregwuike kpatara ama ama mee maọbụ nke amaghị ama."" Ndị ọgba bọọlụ kwesiri ịkwanyere onweghị ha ugwu." afirika-54749055,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54749055,Ideh Chukwuma Innocent: E buru m ọtụtụ a gbara egbe na Lekki gawa ụlọ ọgwụ,"Chukwuma Innocent Ideh, onye na-emepụta ihe nkiri Nollywood (filmmaker) so na ndị mere ngagharịiwe na Lekki Toll Gate n'abalị 20/10/2020.","Onye Igbanke dị n'okpuruochichị Orhionmwon dị n'Edo steeti, Ideh ji isi ghọọ mgbọ dịka o gbochiri ndị agboro wakporo ụlọakụ n'ọgbaghara sochiri ọgbụgba egbe ndịagha gbara ndị na-eme ngagharaịiwe na Lekii Toll Gate. Onye mere akụkọ a bụ Uche Akolisa, ebe onye eserese bụ Vining Ogu" afirika-53171900,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53171900,Nollywood: 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo,Dịka ndị mmadụ na-ajụ ma na-ekwu na ọ bụ ị gwọ ọgwụ ka e ji mara Kanayo O kanayo na ndị igbo nọ na Nollywood.,"Kanayo bidoro were sị ""Ihe anyị na-eme na Nollywood bụ ịnyomi ihe na-eme n'obodo ma na-egosi etu obodo dị"". O kwuru sị "" ị na anụ maka ndị mmadụ na-efu izuụka ọbụla mgbe ha na-eme, anọkata chọwa ha achọwa ma asịkwa na-eji ha mee ọgwụ ego. Anyị na-eme ihe ejije iji gwa ndị mmadụ ka onye na-eme njem kpachapụ anya"". Kanayao rụtụrụ aka mgbe Ruben Agbati dere edemede maka ihe dị omimi n'asa rock were sị "" Ihe anyị na-agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'ihe ejije anyị bụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe; kedu ihe onye bịara ị rụrụ obodo ọrụ ji ịgwọ ọgwụ eme?""." afirika-48135423,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48135423,World Press Freedom day: 'Ndị ntaakụkọ chọkwuru ego nke ha',E mee nwata ihe emere ibe ya obi adị ya mma.,"Ọ bụ okwu a ka ndị ntaakụkọ sonyere na mkparịtaụka ""BBC news Igbo"" mere n'elu soshal midia n'ụbọchị mmemme nwereonwe ndị ntaakụkọ na mbaụwa niile kpụ n'ọnụ. Mmadụ abụọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Clara Okoro bụ onyeisi Brand World Media nakwa Emeka Madunagu bụkwa onye rụburu New Telegraph ọrụ dịka onye ntaakụkọ. Content is not available End of Facebook post, 1 Ha gbadoro ukwu n'isiokwu atọ. Nke mbụ bụ okwu ha na-agwa gọọmenti gbasara ịmapụta ego maka ịkwado ndị ntaakụkọ n'ụzọ pụrụ iche. Ha nyere ndị Naịjirịa ndụmọdụ na ha na-enyocha ozi ọbụla ha na-ahụrụ maọbụ nụ maka ya. Ndụmodụ ha nyesi ndị ntaakụkọ niile bụ ka ha kwudo n'eziokwu makana ọ bụ ndụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56467635,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56467635,Emmanuel Chisom: 'Na nrọ ka m mụtara iji 'carton' arụ igwe na-enye ọkụ',"Ikokwu Emmanuel Chisom bu nwata akwụkwọ dị afọ 12 na-ewuzi ọfụma na soshal midia ka ọ rụchara igwe ọkụ na ntuoyi ji ""battery"" arụ ọrụ.","Ọ bụ umụ he atufusiri atufu ka Emmanuel ji ruọ ihe ndi a ọ rụrụ. O nwetere ohere ịgụ akwụkwọ n'efu n'ụlọ akwụkwọ atọ maka ihe a ọ na-emepụta. N'ihe onyonyo a, Emmanuel kọwara na ọ bụ na nrọ ka a na-egosi akọ na uche etu o si arụpụta ihe ndị a. Onye mere akukọ a:Nnamdi Agbanelo" media-52317852,https://www.bbc.com/igbo/media-52317852,Coronavirus Tips: Anwụnta anaghị ebufe mmadụ coronavirus,Akụkọ na-ekwu na anwụnta nwere ike ikesa ọrịa coronavirus bụ okpotokpo asị.,"Otu 'World Health Organisation' ekwuola nke a komkom hoohaa. Etu coronavirus si efesa bụ site n'ụkwara, uzere maọbụ azụzụ onye nwere ya bụ ọrịa. Nke kpatara o ji dị mkpa ka ị nọtee onye na-akwa ụkwara aka. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chioma Obianinwa, Chukwunaeme Obiejesi na Nnamdi Agbanelo" afirika-44141191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44141191,Ụlọikpe atọhapụla Dino,Ọkaikpe Narisu Ajanah nke ụlọikpe ukwu nke Kogi steeti enyerela Omeiwu Dino Melaye ohere ịpụ na mkpọrọ.,"Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu Ọkaikpe Narisu kwuru na Melaye ga-akwụ nde 10 tupu ọ nawa maka ""ahụ adịghị ya"". Cheta na Melaye nọ n'aka ndị uweojii maka ebubo eboro ya banyere ndị ntọọ a nwụchịkọrọ na Kogi steeti, bụ ebe ya n'aka na-achị steeti ahụ adịghị ya. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ga-amasị gị:" media-52689091,https://www.bbc.com/igbo/media-52689091,Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ,Anya mmadụ bụ ugogbe o ji ahụ ụwa.,Ya mere o ji dị mkpa ka ọ kpachapụrụ ya anya. Onye ọkammụta n'ihe gbasara ilekọta anya bụ Nneoma Sibigam kwuputara ihe ise i ga-eme iji chekwa anya gị. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Adline Okere Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-53619755,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53619755,Ọgba mbọ: Lee Nwoke gbara afo 57 nwaanyi na-anwuru ka o mee ha isi,"Success Okorie bụ nwoke dị afọ 57 ji ime ụmụnwaanyị isi agba mbọ n'Owere, Imo steeti.","Okorie gwara BBC Igbo etu o si malite n'ihazi egwu ma si na ya wụbanye n'imezi isi kemgbe afọ 35 gara aga. Ka o si kwuo, ọ zụọla ihe ruru mmadụ narị anọ (400) n'ọrụ aka a. O kwukwara na ụmụ ya amụọla ọrụ aka ya a, ma jirikwa ya na-akpa ego n'agbanyeghi na ha agachaala mahadum Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke na Nnamdi Agbanelo" afirika-52559974,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52559974,International Day of the Girl Child: Lee ihe gosiri na ụmụnwaanyị Igbo bụ ọkaibe,Kepukepu na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo anaghị agụ akwụkwọ ọ bụ ezie ka ọ bụ okpotokpo asị?,"Igbo sị na anaghị ekpuchi afọ ime aka nke mere ka anyị mee nyocha i ji mara nke bụ eziokwu na nke bụ akụkọ ndị omekome n'ihe gbasara ụmụnwaanyị na agụm akwụkwọ. Kama tupu anyị azọpụ njem a, ụmụnwaanyị Igbo dịka Chimamanda Adichie, Ngozi Okonjo-Iweala, Oby Ezekwesili, Flora Nwampa, Buche Emecheta,Onyeka Onwenu, Dora Akunyili, Joy Uche Ogwu,dgz. Anyị bido taa anyị agaghị ede cha. Ala Igbo nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị meterela ihe e ji echeta ha ma na Naịjirịa ma n'ụwa gbaa gburugburu Lee ụfọdụ ụmụnwaanyị Igbo bụ ijele n'ihe ha na-eme Chimamanda Adichie Adichie bụ onye odeeakwụkwọ a ma ama na mba ụwa niile Adichie so n'otu ada ndị Anambara ji aba mba ma na Naịjirịa ma na mba ụwa gbaa gburugburu. Ọ bụ site n'ihe o detere n'akwụkwọ dịka ode akwụkwọ pụrụiche? Ka ọ bụ site n'okwu o kwutere site na nkwenye o nwere na nwoke na nwaanyị ha nhatanha nke a kpọrọ ""feminism"" na Bekee? A ga-ekwu ole ghara ole ebe ọ gbasara nwaada a? Ọ bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo okwu ebe niile enwuru ọkụ. O nwetala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite karịrị iri. A mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 1977. Dora Akunyili O nwetara nturuugo ruru narị itoolu n'ọrụ ọ rụrụ Otu nwaanyị a na-asị ""unu abịala""; nwaanyị a mere ihe e ji echeta ya ma n'ọnwụ. Akunyili zọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ site n'ibuso ndị na-arụpụta ọgwụ adịgboroja agha, oge ọ rụrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ a kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC). Ọ rụrụ dịka minista na-ahụ maka mgbasa ozi site n'afọ 2008 ruo 2010, tupu ọ zọọ ọkwa onye omeiwu ukwu ga-anọchite anya ndị Anambra Sentralụ; mana Chris Ngige ekweghi ya zọta oche ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị 1954, ọ nwụọ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun 2014. Ngozi Okonjo-Iweala N'agbanyeghi na a mụrụ ya na Delta steeti, mana a ga-agụnye ya n'okpuru ụmụnwaanyị Abịa steeti makana ọ bụ ebe ahụ ka a na-alụ ya. A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala? A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya. A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm. Ọ bụ onye ihe gbasara ego na nchịkọta akụnaụba doro anya ọfụma. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, 1954. Oby Ezekwesili Ezekwesili bụ ezigbote agbara nwaanyị a ga-akpọ ""a kwaa a kwụrụ"" n'okwu gbasara Naịjirịa. A ga-akọ ole ghara ole maka nwaanyị a pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, na-ama gọọmentị aka n'ihu ma bụrụkwa onye na-ebu ịzọta ikike dịrị onye n'isi? Ezekwesili arụọla dịka minista ugboro abụọ na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo chịrị, ma sorokwa n'ime ndị Naịjirịa rụtụrụla na ngalaba ụlọakụ mbaụwa a na-akpọ World Bank. A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ 1963. Uche Jombo Uche Jombo enwetala ọtụtụ ihe nrite maka ime ejije Ọ bụrụ na ị na-ele ejije ndị Nollywood ma ị maghị onye nwaanyị a bụ, i lewela? Jombo na-eme ejije dịka ""actress"" ma na-emepụtakwa ejije dịka ""director"". A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1979. Virgy Etiaba Etiaba chịrị site n'ụbọchị abụọ nke Nọvemba 2006 ruo Juun 13 nke 2007. Ị ma na ọ bụ Etiaba bụ nwaanyị mbụ chịrị steeti ọbụla na Naịjirịa? Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti, rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1942, dịka wikipedia si kwuo. Onyeka Onwenu Onyeka Onwenu bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ n'okpuru Ikedi Ohakim Onwenu bụ ""olu ogene"" nakwa agbara nwaanyị ma a bịa n'ihe gbasara ịgụ egwu. Dimkpa nwaanyị a bụ otiegwu, ọ rụburu dịka onye ntaakụkọ na BBC/NTA, ọ na-emekwa ejije na Nollywood kwa mgbe. O nwetala nturuugo dị icheiche maka ime ejije nakwa egwu ya. Genevieve Nnaji Genevieve Nnaji nwere nturuugo ""Member of the Order of the Federal Republic"" nke gọọmentị etiti nyere ya n'afọ 2011 A kọwa akụkọ maka ejije na Naịjirịa ma a kpọbeghị aha nwaanyị a Imo steeti ji eme ọnụ, aha e bidokwalanụ? Nnaji emeela ejije karịrị narị, ma nweta ihe nrite nakwa nturuugo karịrị iri. Ọ na-emepụtazị ejije nke ya ugbua, o mepụtara nke ndị ọnụ na-eru n'okwu na Hollywood zụụrụ. A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 1979. Linda Ikeji Ikeji bụ otu onye a na-akpụkarị n'ọnụ na Naịjiria ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ide ihe n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ ""Blogging"". Ọ nwere ụlọmgbasaozi nke ya, ọ bụkwa onye ọmepụrụ onye n'ihe gbasara ilekọta ụmụagbọghọ. O nwetala nturuugo ma na Naịjirịa ma na mba ofesi. A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba, 1980. Chioma Ajunwa Ajunwa bụkwa onye ọgba ọsọ mgbe ahụ, bụzị onye uweojii Naịjiria ugbua Ihe Ajunwa mere n'egwuregwu Naịjirịa so n'ihe ndị mmadụ ga-akpụgide n'ọnụ n'ụwatụụwa. O ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo mbụ ya n'Olimpiks n'afọ 1996. O nwere nturuugo ""Member of the Order of Niger - MON"" A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba, 1970. Flora Nwapa Nwapa tinyere uchu n'ịrụgharị ala Igbo mgbe a lụchara agha Biafra E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Nwapa? Ọ dị egwu! Nwapa bụ 'a takata a gbọo' n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ. Ọ rụkwara dịka onye nkuzi, minista na-ahụ maka ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ, ma mechaa rụọ ka minista na-ahụ maka ala na mmepụta obodo. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931, mana ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993. Osinachi 'Sinach' Joseph (Kalu) Sinach agaala ọtụtụ mba dị iche iche gaa gụọ egwu ya Sinach dịka e si mara ya, bụ otiegwu pụrụiche. Ihe gbasara Chineke na ụka Kraịst na-amasị ya nke ukwu, mere ka ọ na-eti naanị egwu ụka. A ga-ekwu ole ghara ole? Ọ na-agụ agụ, ma na-edekwa ede. O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Maachị, 1973. Grace Amah Ị bụrụ onye na-ele ihe nkiri ndị Nollywood mgbe gboo, ị ga-amarịrị onye Amah bụ. Aha ya wuru ewu ọfụma oge ndị dị ka Sandra Achums, Regina Askia na Rita Nzelu ""na-achị"" Nollywood. A mụrụ ya ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị. A bia n'ihe gbasara ule, ụmụnwaanyị Igbo na-agbalị. A sị ka agụpụta steeti iri kachasi nwee ụmụnwaanyị gbara ule WAEC site n'afọ 2016 ruo afọ 2018, ị ga-ahụta na ụmụnwaanyị Igbo zatara aha ha. (Ebe e si nweta ya) A sị kwa ka achọpụta ụmụnwaanyị ole gafere ule WAEC, ụmụnwaanyị sị mpaghara ọwụwa anyanwụ so na ndị kachasị. Lee ya site n'afọ 2016 ruo 2018 na pacenti. Ọnụ ọgụgu a gosiri na ụmụnwaanyị ndị si na steeti ndị dị na ọwụwa anyanwụ na-agafe ule WAEC ma atụnyere ha na ndị nke steeti dị n'ọdịda anyanwụ. Etu ọ dị na Bar Chart Ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị lere ule WAEC (Ebe e si nweta ya) Ọ bụghị akụkọ ọhụru na anaghị edokwa ọnụ ọgụgu dị iche iche na Naijirịa nke ọma. Kama ngalaba na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ n'Anambra steeti (Anambra Bureau of Statistics) nke ọnyeisi ha bụ Emeka Paul Obiekezie nyere anyị ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị na ụmụnwoke ndị nọ n'ụlọ akwụkwọ prịmarị na Sekọndịrị n'afọ 2017. Lee ka o sị kwụrụ n'Amabra Steeti: Ndị ""Junior Secondary"" Ndị ""Senior Secondary"" Ndị Primary Nyocha a ga-egosi gị na ụmụnwaanyị igbo ejighị agụ m akwụkwọ egwu egwu. Lee ka o sị kwụrụ na Delta Steeti: Ụmụnwaanyị Delta ekweghị kwa ka ụgbọ agụm akwụkwụ hara ha. Onyeisi ngalaba ọnụ ọgụgụ na Delta Steeti bụ Joe Oghogbi nyere anyị ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị nọ n'ụlọakwụkwọ gọọmentị nke ha depụtara n'afọ 2018. Ndị Prịmarị Ndị Sekọndịrị Ndị Mahadum Ugbua, zara anyị ajụjụ a; Ụmụnwaanyị Igbo a na-aga akwụkwọ? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45325142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45325142,Jim Iyke ọ dabara na nsogbu ndị uweojii?,Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ndị uweojii nke ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed na Legọs anwụchiela Jim Iyke bụ omeiheonyonyo.,"Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, anwụchiri ya mgbe ọ mara onye ụlọọrụ ọla mgbe ọ na-achọ ị me ya nyocha. End of Instagram post, 1 Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ mara nwoke ahụ ọra ebe ọ na-achọ ịnyere ya aka mee ọsịsọ banye n'ụgboelu njem ya tupu ihe a eme. Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Dana Air bụ Kingsley Ezenwa kwuru na ihe a mere ma kwuo na atọghapụọla Jim Iyke dịka ọ rịọrọ biko. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na ọdọ ụgbọelu bụ Alabi Joseph kwukwara na atọghapụọla ya bụ omeiheonyonyo. Jim Iyke agaghịzi njem ya n'ihi okwu a." afirika-50182275,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50182275,Akiddie: Asụsụ Igbo abaala na teknụzụ,Asị na ọ bụ ụkọ na-ebute nchọpụta ọhụrụ.,Ihe a bụ akụkọ Dominic Onyeka bụ onye mepụtara App akpọrọ Akiddie. Akiddie nyere ụmụaka ohere ịgụ akụkọ dị iche iche n'asụsụ ha. Lee ihe ngosi a. Ndị hụrụ maka ihe nkiri a: Nnamdi Agbanelo na Chiemela Peters. afirika-54764856,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54764856,BBC Africa Eye: Ndị Crowd1 abụ ndị wayo ka ha abụ nke ezigbo?,BBC Africa Eye mara imi n'ala ịchọpụta ma ụlọọrụ Crowd1 kwuru na ha anaghị egwu ndị mmadụ wayo abụ ndị wayo n'ezie.,"Ha kwuru na ha bụ ihe Bekee kpọrọ ""Network Marketing"", mana site na nnyocha BBC mere, ọ dị ka e nwere ndị ọ na-adabara karịa ibe ha. Otu nwaanyị tụfuchara ego niile o nwere n'ụwa ka ọ na-achụ nta ego ndị Crowd1 kwere ya na nkwa, kọwara etu obi si agbawa ya n'ihi na ọ bụrụla ogbenye ọnụ ntụ. BBC chọpụtakwara na nkwa niile ndị Crowd1 na-ekwe ndị mmadụ na ha ga-eme ha ọgaranya abụchaghị n'ezie n'ihi na e nwere ndị ego a na-aba n'akpa ha karịa ndị ọzọ. Lee ihe niile BBC Africa Eye chọpụtara maka ha na ebe ha kwụ ugbua n'uju:" mba-uba-51790197,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-51790197,International Women's Day: Onweghị ihe ọbụla nwaanyị agaghị emenwu - Nwaanyị Nigeria na-arụ na NASA,"Ọtụtụ ọrụ dị icheiche dịka Njinia, bụ nke ọtụtụ mmadụ na-ahụta dịka ọrụ ụmụnwoke.","Mana Wendy Awele Okolo, e gosila na onweghị ihe nwoke mere nwaanyị agaghị enwe ike ime. Awele bụ ihe ndị Bekee kpọrọ 'Aerospace Engineer'. Ọ na-arụ ọrụ n'ụlọorụ 'National Aeronautics and Space Administration' nke mba Amerịka Dịka a na-eme emume ncheta ụmụnwaanyị n'ụwa niile taa, Awele kọọrọ BBC Igbo etu njem ya si malite. Kirie ya n'uju. Ndị mepụtara ihe nkiri a bụ Chimamaka Ihenacho na Vining Ogu." egwuregwu-43946220,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43946220,Barcelona atụrụ ụgo nke 25 n'asọmpi La Liga,Barcelona chịkọrọ iko asọmpi La Liga nke afọ agbata 2017 na 2018 n'ọchịchị Ernsto Valverde nke mbụ dịka onye nchịkọta otu ahụ.,"Messi bụ onye mbụ nyerela goolu karịrị iri atọ n'ime afọ asaa nke asọmpi La Liga. Lionel Messi nyere ọkpụ goolu atọ n'ime asọmpị ahụ nke gbatịkwuru ogogo Barcelona na tebụlụ La Liga. Messi bụ onye nyerela goolu iri atọ na abụọ n'afọ a bụ onya kachasị enye goolu n'asọmpi La Liga. Nke a bụ ugbo iri abụọ na ise Barcelona na-amabute iko La Liga, ebe ha ji nzọm ụkwụ asatọ na-eso ndị Real Madrid. End of Twitter post, 1" afirika-49823057,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49823057,"Jim Nwobodo: Umahi hapụrụ PDP banye APC, ọ bụ APC ga-enye ndị Igbo ọkwa onyeisiala?",Aka chịburu Enugwu steeti bụ Jim Nwobodo ekwuola na ọpụpụ gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi pụrụ na pati ya bụ 'Peoples Democratic Party' gaba APC agaghị achịtara ya aja.,"Jim Nwobodo na Dave Umahi Nwobodo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde. O kwuru na ọ bụ ihe ""gbara m nnọọ gharịị""na Umahi ga-esi na PDP pụọ ugbua o doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ ndị Igbo ka o ruru inweta ọkwa onyeisiala. Ọ gara n'ihu kwuo na dịka onyeisi otu ndị Gọvanọ nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụ Umahi kwesịrị iso na ndị ga-agba mbọ hụ na oke ndị Igbo ruru ha aka. Cheta na gọvanọ Umahi kọwara na ihe o ji pụọ na PDP bụ maka mmegbu ha na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe afọ 1999. Ihe ndị Ebonyi kwuru maka Umahi ịbanye APC Mana Nwobodo jụrụ sị: ""Ebe Umahi sị na PDP enyeghị ndị Igbo ohere ịbụ onyeisiala, ọ bụ APC ga-enye ha ya bụ ohere?"" ""Ihe m nọ ugbua bụ 'sidon look', ka anyị lewenụ anya mara etu okwu a ga-esi gadebe,"" Nwobodo kwuru. Gbasara ịgba mbọ ka onye Igbo nweta ọkwa onyeisiala, Jim Nwobodo kwuru na ya kwadoro atụmatụ ahụ nke ọma, mana oge ka fọrọ tupu amalite ịkpa ya bụ nkata nke ọma. Mbata Gọvanọ David Umahi na APC bụ maka ọdịmma ndị Igbo - Joe Igbokwe Onye bụbụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs steeti bụ Joe Igbokwe ekwuola na obi bụ ya sọ polina polina dịka aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi hapụrụ PDP bata n'otu APC. Na mgbarịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'abalị Tọzde, Igbokwe kwuru na ọpụpụ Gọvanọ David Umahi pụrụ na PDP banye ga-ewetara Igbo oke pati ahụ wọrọ ha na Naijiria kemgbe ha jiri malite. Ọ sịrị na ihe mere Umahi jiri hapụ PDP bụ na ""nwa ọ na-eku anwụọla."" ""PDP anwụọla na Ọdịda Anyanwụ(South West. Ọ na-achọ ịnwụ na Ọwụwa Anyanwụ(South-East)."" ""Ọ bụrụ na ị bịara iku nwa, nwa ị na-eku anwụọ, gịnị ka ị ga eme? Ị lawa. PDP anwụọla."" Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị ihe ndị Igbo ritere na nkwado PDP afọ iri na isii ha nọrọ n'ọchịchị mana na ha ji anya ahụ ihe APC na-emere ha na-agbanyeghị. O kwuru na APC arụwala ndị Igbo akwa Naijia nke abụọ nke PDP emelighị karịa iji ya azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị. Igbokwe onye kwupụtara olileanya na ndị gọvanọ ndị ọzọ ka-eso Umahi bata APC, kwuru na ụwa ga-akara Igbo mma ọ bụrụ na ha nyewa otu APC nkwado zuru oke. Cheta na Ụmahi hapụrụ PDP na nsonso ma kwuo na ihe mere ya jiri zọpụ ụkwụ bụ n'ihi mmegbu PDP na-emegbu ndigbo kemgbe afọ 1998 ha banyere n'ọchịchị. Onye ndụmọdụ Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steetị n'okwu nchekwa bụ Chidiebere Egwu agbaala arụkwaghịm n'ọrụ ya. Egwu bụbukwa onyeisi okpuruọchịchị Ikwo sị na ọ ka-abụ onye otu PDP na-agbanyeghi na Umahi banyere APC, nke a mere o ji gbaa arụkwaghịm. Cheta n'izu gara aga ka Gọvanọ Umahi kwupụtara uche ya ịbanye APC, ọtụtụ ndị APC n'Ebonyi gbakwara arụkwaghịm n'ọrụ ha. Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi n'ime otu. Nke a na-abịa dịka Umahi nakwado emume mwụfe ya site na PDP banye APC n'ụbọchị Tọsde 19 ọnwa Nọvember, 2020. Ndị gọvanọ gụnyere Mai Mala Bala nke Yobe Steetị, Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi na Mohammed Badaru nke Jigawa Steetị. Osote gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Kelechi Igwe na onyisi ụlọomeiwu ha bụ Francis Nwifuru nabatara ndị a n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. A na-atụ anya na ndị gọvanọ abụọ ọzọ ka ga-awuchi n'Ebonyi maka emume a. Elders Council: E wepụla Franklin Nchita Ogbuewu were Okah dochie ya Dịka Gọvanọ Ebonyi steeti hapụrụụ PDP gawa APC, e kposala ọgbakọ ndị okenye steeti ahụ a kpọrọ ""Elders Council"" nkeFranklin Nchita Ogbuewu nọ n'isi ya ma weren Ben Oka dochie ya. . Dịka ozi nke Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Uchenna Orji si kwuo , ""ọ bụ iji kpalite mụọ ọhụrụ notu ahụ dịka gọvanọ Dave Umahi siri nye ntuziaka ka ekposaa ndị ndu ọgbakọ ahụ malite n'abalị 18 nke ọnwa Novemba."" Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisioche ọhụrụ bụ Ben Okah ga-amalite ọrụ ozigbo. Nzọpụ ụkwụ gọvanọ Umahi a na-abịa dịka Ogbuewu jụụ iso ya banye otu APC. Onyeisioche PDP n'Ebonyi ajụla ịrịtu n'ọkwa ka Gọv. Umahi banyechara APC Onyeisioche otu PDP na Ebonyi steeti na-apụ apụ bụ Ọkaiwu Onyekachi Nwebonyi ekwuola na ma e tere ogiri ma e tere ụgba na ya ka bụ onyeisioche pati ahụ na steeti ahụ. Nkwupụta ya a na-abịa dịka ndị isi PDP etiti nọ n'Abuja gbosara otu ndị isi nke Ebonyi steeti dịka akụkọ pụtara nke kwuru na Govanọ Umahi ahapụla pati ha gawa APC. Orji Uzo Kalu sị na o dịzị ka ndị Naijiria anaghịzi ahụ onwe ha n'anya Mana Nwebonyi kwuru na mkparịtaụka ya na andị ntakụkọ nwere n'Abakaliki ụbọchị Wenezde na mkposa otu ha megidere iwu ma sị na ya ga-agbagha ya bụ mkpebi PDP etiti n'ụlọikpe. Ọ sị, ""Anya mụ eluola akwụkwọ mgbasaozi nke odeakwụkwọ etiti PDP wepụtara nke o kwuru na e kposaala ndị isi pati na Wọọdụ, okpuru ọchịchị nakwa nke steeti na Ebonyi n'ihi na Gọvanọ David Umahi chọrọ ịga APC."" "" Ọ bụ ihe ịkpa ọchị na ndị isi pati n'etiti kulitere kposa ndị isi nke steeti n'ihi na gọvanọ na mmadụ ole na ole chọrọ ịhapụ pati."" 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife ""Anyị bụ ndị na-elekọta pati aha n'Ebonyi steeti rue afọ anọ na-abịa. dịka a họpụtara anyị site na ntuliaka e mere na nsonso a."" Nwebonyi gara n'ihu kwuo na ndị ndu PDP n'Ọwụwa Anyanwụ agaghị enye ohere ka e were aghụghọ ghọpụ Ọwụwa Anyanwụ n'ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, mana ha hara ka akpazi ụka kama ịhapụ pati ha. Odeakwụkwo APC n'Ebonyi steeti agbaala arụkwaghị m maka mbata Umahi n'APC Nwoba Chika Nwoba bụ odeakwụkwọ pati APC dị n'Ebonyi steeti agbala arụkwaghị m maka mbata gọvanọ Dave Umahi na pati ahụ. Nwoba kwuru na ọ gbara arụkwaghịm makana ọ hụghị gọvanọ Umahi dịka onye bu ọdimma ndị Ebonyi n'obi nakwa ọ chọghị ka o nọrọ n'etiti udiri ọchịchị ndughie ya. Onye mụnyere ọkụ gbara n'Ebonyi? Nwoba depụtara maka igba arụkwaghịm ya n'akara facebook ya. O kwuru na mbata Umahi n'Ebonyi steeti ga-ebutere steeti ahụ ezigbo nsogbu makana Umahi ga-aghasa pati APC tupu ọnwa Aprelu nke afọ 2021. Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ onye mgbasaozi Dave Umahi bụ Uchenna Orji kpụrụ n'ala makana o bughi ekwenti ya. Etu onyeisoche APC si nabata gọvanọ Dave Umahi na pati ya Onyeisioche All Progressives Congress (APC) dị n'Ebonyi aha ya bụ Eze Nwachukwu kwuru na ha anabatala mbata gọvanọ DaveUmahi nke Ebonyi steeti na pati ha. O kwuru na Umahi mere ihe gosiri na o nwere amamihe ma burukwa ọdịmma ndị Igbo n'obi. O kwuru na ọ chọrọ ka gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ ndị ọzọ batakwuo na APC ka agbakọ aka nwete ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Odeakwụkwọ APC Ebonyi steeti ọ gbara alụkwaghịm maka mbata gọvanọ Umahi? Onyeisioche APC n'Ebonyi bụ Eze Nwachukwu kwuru na o nweghị mgbe ozi na odeeakwụkwọ APC Ebonyi steeti zitere ya ozi na ọ na-agba arụkwaghịm. O kwuru na ọ na-anụ ozi ahụ etu a anyị si anụ ya dịka kepukepu. Mbọ BBC gbara ịnụta n'ọnụ Chika Nwoba bụ odeakwụkwọ APC n'Ebonyi steeti kpụrụ n'ala dịka ekwenti ya na-ekwu na-agbanyụrụ ya. Cheta na aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emeso mpaghara ọwụwa anyanwụ mere o ji pụọ na pati ahụ. A ma m ihe mere Dave Umahi ji si PDP gbalaga APC- Nyesom Wike Aka na-achị Rivers State bụ Nyesom Wike ekwuola na ọ bụ maka ịchọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa mere gọvanọ Dave Umahi ji gbabaa pati APC nọ n'ọchịchị ugbua. O kwuru na ọ bụghị okwu ikpe akwụghị ọtọ nye ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ kpatara ọpụpụ Umahi dịka akụkọ si ekwu. O kwuru na ọgbagojughị ndị bụ ezigbo ndị otu PDP anya na Umahi agawala APC makana o teela okwu na-egosi na nke a ga-eme. Wike kwuru na etu Umahi si kwuo na ọ bụ mmegbu PDP na-eme ndị ọwụwa anyanwụ bụ ihe were ya iwe maka ọpụpụ Umahi. 'Ugbua e nweela m nwanne na APC' - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma eziela ozi nnabata Dave Umahi na-achị Ebonyi steeti dịka ọ batara otu APC. N'ozi nke o ziri n'akara Twitter ya, Uzodimma kwuru na ọ bụ ọṅụ ka o ji nabata akụkọ na Dave Umahi ahapụla otu PDP bata na APC. ""Ugbua, ọ bụghị naanị m bụ onye APC nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ, e nweela m nwanne ugbua"" ka o kwuru."" Ihe otu PDP kwuru maka ọpụpụ Umahi N'otu aka ahụ, otu PDP ekwuola na Davew Umahi na onwe ya bụ onye ma ihe o ji hapụ otu ha nke ga-apụta ihe mgbe oge ruru. Ha kele kwara ya maka ọrụ niile na mbọ niile ọ gbaara otu ha kemgbe o bara n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2003. Gọvanọ Dave Umahi sị na onweghi mwute ọbụla ịhapụ PDP banye APC Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steetị sị na onweghi mwute ọbụla maka ịhapụ Peoples Democratic Party mabanye n'All Progressive Congress. O kwuru nke a mgbe ọ na-agba ndị ntaakụkọ okwu n'Abakaliki ma sị na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwanyanwụ. Ọ sị na mkpebi a abụghị maka na o nwere nkwa APC kwere ya kama ọ bụ ụzọ o nwereike iji gosi iwe ya na mmegbu PDP na-emegbu ndị Ọwụwanyanwụ kamgbe afọ 1998. Ọ sị na mwụfe ya a ga-eme ka anya mepee ndị PDP ka ha mara ọbụla naanị otu onye nwere ikike ime ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ katọkwara akụkọ na-ekwu na ọ bụ maka PDP jụrụ inye ya ohere ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 na-abịa abịa. Gọvanọ Umahi bụ onyeisi ndị govanọ Owụwanyanwụ sị na afọ juru ya n'ogogo o rurula na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọ ga-alaghachị n'azụmaahịa ya ma ọ rịtuo n'ọkwa n'afọ 2023. Ihe anyị ma maka akụkọ na gọvanọ Dave Umahi awụbanyela na APC Akụkọ na-efegharị kamgbe taa bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 bụ na Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi esila na pati ya bụ 'People's Democratic Party' wụbanye pati 'All Progressives Congress'. Nke a mere ka ndị mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ na soshal midia. Gọvanọ Dave Umahi ọ wụbanyela na APC?Lee ihe ha gwara anyị Onye na-ahụ maka mgbasa ozi gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwaeze gwara BBC na o nweghị ka mbanye gọvanọ Umahi na APC ga-esi bụrụ kepu kepu. O kwuru na udiri ọkwa Gọvanọ Umahi ji dịka onyeisi ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwesịghị ka njem ya si otu patị fere ọzọ bụru ihe a ga-ekpuchị ekpuchi kama na ""anyị cherekwuo ."" N'okwu ya, ọ bụrụgodi na akụkọ a na-efegharị, o nweghi mgbe gọvanọ ji were ọnụ ya gwa ụwa na o sila PDP fere APC. BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ odeakwụkwọ mgbasaozi ndị PDP bụ Kola Ologbodiyan mana o zaghị ekwenti ya. Ọtụtụ na-ekwu na Umahi nwere ike ịpụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 Ụlọntaakụkọ Punch dere akụkọ na-ekwu na Umahi gwara onyeisioche PDP bụ Uche Secondus, na ya chọrọ ịbanye APC. Dịka akụkọ ahụ si kwuo, Umahi kwuru na ihe kpatara ya ji chọọ ịba APC bụ maka na ha ekwela inye onye si mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nkwado ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Umahi kwuru na ọ bụrụ na ndị PDP kwe ya nkwa na ha ga-akwado onye Igbo ịbụ onyeisiala na 2023, na ya agaghị apụ na Pati ahụ. Kepukepu apụtala ugboro ugboro na Dave Umahi na-atule ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023. Mana onwebeghị mgbe ọ pụtara were ọnụ ya kwupụta nke a. Mgbe gọvanọ Umahi wepụrụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ya Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti ewepụla Emmanuel Uzo dịka onye na-ahụ maka mgbasa ozi. Kọmishọna na-ahu maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna ọrji gwara BBC na ọchụchu mazi Uzo bụ eziokwu. Kama ọ sị na ọ matachabeghi ihe mere eji chụọ ya n'ọrụ ma ọ bụ onye ga-anọchi anya ya. N'aka nke ọzo, ndị ọrụ gọọmenti Ebonyi na-achoghi ka akpọ aha ha kwuru na nke a bụ maka na Mazi Uzo arụzighị ọrụ ya nke ọma. Ọ bụ ihe gbasara atụmatụ 'National Livestock Transformation Plan Programme' nke gọvanọ kwuru na Uzo anochịteghi anya ya ọfụma. Onye a kwuru na e nyeghi ya ikeke igwa ndị ntaakuko okwu banyere ya bụ atụmatụ ma kwukwa na ihe Uzo gwara ndi ntaakụkọ dị iche na ihe ndị Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ kwekọrịtara. Dịka ọ dị ụgbụ a amabeghị onye ga-anọchite anya emmanuel Uzo. Gụọ akụkọ ga-amasi gị Lee ihe nkịri ga-amasi gị Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-49440190,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49440190,Herdsmen crisis: Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ,"Gọọmenti Enugwu steeti ekwuola na ihe mere ha ji asụ oke ọhịa dịcha na steeti ahụ bụ ""iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo"".","'Gọọmentị Enugu state sị anyị kpochapụ ebe ndị ntọrị na-ezo' Iji mejuputa nkwa gọọmenti Enugwu kwere banyere nchekwa ndụ na steeti ahụ, ha amalitela ikpocha nnukwu ọhịa dị n'Ihe, Four Corner Ozalla-Udi road wee rue n'Obiagu, Udi. Ya bụ atụmatụ bụ nke ha kwuru na ọ ga-enye aka hụ na ndị ntọrị, ndị ohi na ndị ogbu mmadụ enweghịzị ebe ha ga-ezo ọzọ. Gọọmenti Enugwu steeti kwuru na ha na-asụ ọhịa dị n'okporoụzọ awaraawara iji chụtee ndị omekeome aka Mgbe BBC rutere n'ọhịa Four Corner, Akagbe Ugwu nakwa isi Ozalla, ndị ọrụ ha bụ igbutu osisi na-aru ọrụ ha n'ike n'ike. Lee ihe BBC hụrụ ebe ahụ: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56426232,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56426232,Uche Mefor: Mpaghara Ipob nke m nọ na ya so hibe 'Biafra De facto Customary Government',"Ọ bụ n'abalị Satọde bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ka Asarị Dokubo, Uche Mefor, Ralph Uwazurike na ụfọdụ ndị ọzọ zụtere ndị ntaakụkọ n'ọgba ozi Zoom were kwuo na ha ehibela atụmatu ha kpọrọ ""Biafra Defacto Customary Government.","Ha sịkwa na Maazị Asari Dokubo ga-abụ onyeisi oche ogige ọhụrụ a dịka Uche Mefor ga-abu onye Ode Akwụkwọ ha. Ihe pụtara na nzukọ ahụ na-aga n'ihu bụ na atụmatụ ọhụrụ sonyekwara na-ịchọ nwereonwe mpaghara Naịjirịa dị n'Ọwụwa Anyanwụ iji kewapụta mba a kpọrọ Biafra. Ugbua, e nwere otu Indigenous People of Biafa (Ipob), nwee otu Lower Niger Congress (LSC), nwee Biafra Indepence Movement (BIM) nakwa Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob). Mana Uche Mefor gwara BBC Igbo na atụmatụ ha bụ nchịkọta otu ndị a niile ""maka ọdịmma ndị Biafra"". Ọ kọwara ihe mere ha jiri hibe ya bu ogige nakwa ihe mere ha jiri mee Maazị Asari Dokubo onyeisi oche. Ọ sị, ""Ọ bụghị Asari wepụtere onwe ya, na ọ bụ anyị niile weputere ya."" Gụọ akuko a n'uju. Ọtụtụ ọnụ, otu ebumnuche Otu ndị a niile na-ekwu na ha na-achọ otu ihe. Mana, nke bu eziokwu bụ na ụzọ ha si aga dị iche iche. LNC sị na ha chọrọ iso n'ụzọ ha kpọrọ ""Constitutional Force Majeure"" nke ha na otu ndi ọzọ gbakọrọ n'okpuru ogige a kpọrọ ""Nigerian Indigenous Nationalities Alliance of Self-Determination"". Ha kọwara na site n'atụmatụ ""Force Majeure"" dịka nchabi ihe jikọrọ agbụrụ Naịjirịa niile ibu otu mba. Ipob n'onwe ha na-achọ ka emee ntuliaka n'ọnụdụ nke Bekee kpọrọ ""Referendum"" iji mara ndị chọrọ ikewa nwereonwe ha na ndị chọrọ ịnọ na Naịjirịa. Nke bụ eziokwu ma enyochaa ebumnuche otu ndị a niile bụ na, ha chọrọ otu ihe - nwereonwe." media-49710271,https://www.bbc.com/igbo/media-49710271,BB Naija 2019: E nyela Khafi ọsọ,E nyela Khafi ọsọ n'egwuregwu Big Brother Naija.,"Ọ bụ n'abalị Sọnde ka nke a mere. Ezigbo aha Khafi bụ Kareem Ahmed. Ọ gbara afọ iri abụọ na itoolu. Cheta na Khafi bụ onye uweojii na mba Ịngland. Ọ hapụrụ ihu ọrụ ya dịka onye uweojii wee sonye n'emume 'Big Brother'. Dịka ndị uweojii 'Scotland Yard' si kwuo, ""Otu onye uweojii nke ngabala 'Transformation Command' dere akwụkwọ ka e nye ya ikike i so n'ihe nkịrị nke onyonyo, kama enyeghị ya ikike"". ""Anyị ma na onye uweojii a so na ihe nkiri a ma ọ na-eme nke ahụ n'ike nke ya."" Ihe a ga-eji cheta Kaffy bụ na ọbụ ya ritere ụgbọala nke ụlọọrụ ụgbọala Innoson bupụtara maka egwuregwu 'Big Brother'. O ritere ụgbọala ahụ ka ya emechara asọmpi a kpọrọ 'proudly Nigerian challenge' n'ọnwa Ọgọst. Ka ọ dị ugbua, ọ fọla mmadụ iri n'egwuregwu 'Big Brother Naija' Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara" 45026832,https://www.bbc.com/igbo/45026832,Buhari aburula onyeisi Ecowas,Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari aburula onyeisioche ọhụrụ otu jịkọrọ mba nọ na'ọdịda anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas n'aha Ịchafụ.,"Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Nke a mere na ngwụcha ọgbakọ Ecowas e mere na Lome, isiobodo mba Togo. Otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bashir Ahmad bụ onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter ya. End of Twitter post, 1 Cheta na ndị isi mba dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka gbakọrọ na Lome ịkpa maka udo, nchekwa na ịlụ ọgụ megide iyi ndụ egwụ." afirika-45562424,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45562424,Nwata akwụkwọ akwụọla ụdọ na mahadum Nsugbe,"Nwata akwụkwọ akpọrọ Phillips Chinedu dị afọ iri abụọ na itoolu akwọola ụdọ na Mahadum ndị nkuzi bụ ""College of Education Nsugbe.""","Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na enyi nwoke Chinedu bụ Obinna Joseph were ha mkpesa na ọ hụrụ ozu Chinedu ka ọ kwụrụ ụdọ n'ime ulọ ya. Mgbe ndị uwe oji nwetara ozi a, ha gara ebe ihe a mere ma buru ozu Chinedu gawa ụlọ ogwu ebe dọkita kwuru na ọ nwụọla. E bugara ozu ya n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu ebe a ga-eme nyocha ihe mere ya. Ndị uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ya bụ ihe mberede ka ha wee chọpụta ebe ya bụ mmiir sị banye opi ụgbụghịrị. Akụkọ ndị ga-amsị gị:" afirika-45380899,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45380899,"#EndSARS: A chụọla onyeuweojii maka ịna akaazụ N5,000",A chụrụ Charles Omotosho bụ ịnspectọ na-arụrụ FSARS ọrụ na mpaghara Ikorodu dị na Legọs maka ịnapụ ndị na-akwọ ụgbọala bị na mpaghara ahụ ego.,"@PoliceNG_PCRRU Osote onyeisi ndị uweojii bụ Abayomi Shogunle gwara BBC na ihe ahụ mere n'ezie. Shogunle sịrị na a chụrụ Omotosho maka ị naa aka azụ. O kwuru na ebukwara ndị uweojii atọ ndị ọzọ ha na Omotosho soro nwere kpaa akwụ n'ọkwa. End of Twitter post, 1 Nke a na-eme ka ọ gachara ọnwa atọ otu onye bi na Ikorodu a kpọrọ Princess Ife depụtara na ya ji ekwenti ya zigara nwaadi ahụ bụ Omotosho ego ka majara ya na ya ga-agbagbu ya ma ọ bụrụ na ya akwụghị ya puku naira ise. Akụkọ ga-amasị gị:" 42910066,https://www.bbc.com/igbo/42910066,Onye nsoso: Ihe Liverpool mere wuterem ọfụma,"Ka mgbe emechịrị ahịa orire na ọzụzụ ndị egwuregwu bọọlụ ụnyahụ, ọtụtụ mmadụ hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya ekwuola ihe dị ha n'obi gbasara ihe mere na ya bụ ahia.","Alex Sanchez so na ndi aha zụrụ ụyahụ Niran Adesanya bụ onye nta akụkọ egwuregwu gwara BBC Igbo na ahịa ụyahụ gara nkeọma. ""Olivier Giroud gara Chelsea enweela isi ọma. Chelsea nwekwara uru na ahịa nke a, makana ha zụrụ Giroud na nde pounds ịrị na asatọ,"" Adesanya kwuru. Lucas Moura a ga la Tottenham O kwukwara na""Ego e ji zụ Aymeric Laporte dị ọnụ n'uche m"". Ego e ji zụ Van Dijk garakwara ọnụ"" Mana ọbi adịghị Stephen Mbonu mma. Ọ bụ onye n'ahụ Liverpool n'anya. Mbonu kwuru na ""kedu ka Liverpool ga esị re Philippe Coutinho mgbe a mara na onweghị onye ọzọ ga nọ chi ya. Ugbua, otu Liverpool akwụsịghị ike maka anyi ezurezu"" Mesut Ozil ebinyeela aka n'akwụkwọ rue afọ 2021 Mana Tony Chinenyelum bụkwa oye nso nso Manchester United gwara onye nta akụkọ anyi na ""e chekwudo m oge ahịa ọzọ, otu nkem bụ Man U ga-zụ Ronaldo makana onye isi anyị bụ José Mourinho bụkwa onye n'eme ihe itụ anya"" Ahịa egwurugwu bọọlụ mechịrị na abali ụnyahụ." afirika-50433854,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50433854,Igbo Language: Gịnị bụ 'Blue' n'asụsụ Igbo?,Asụsụ Igbo ụfọdụ na-ara ahụ na-adịkwa mfe ụfọdụ oge.,Mana ịkpọpụta agwa dị iche iche nke Bekee kpọrọ 'Colour' a dị mfe? Lee etu ndị mmadụ si nwaa ike ha n'ịkpọpụta agwa nke a kpọrọ 'Blue' afirika-43480508,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43480508,Akụkọ kachasi taa: Ihe na-ewe ụmunwaanyị na Toni Kan iwe,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe maka ọchụchụ Ndị otu ụmụnwaanyị akpọrọ Coalition of Women for Justice mere ngagharị iwe n'Enugwu iji gosi na obi adịghị ha mma maka ọchụchụ n'ọrụ ndị Globacom chụrụ ụmụnwaanyị ndị lụrụ di na ndị mụrụ nwa. Mana ndị ụlọ ọru Globacom kwuru na ọ bụ maka na ha anaghị eme ọfụma na ọ bụghị sọsọ ndị luru dị ka ha churu n'ọrụ. Pia ebe a ka ị gụọ ya n'uju. 'Ndị na-achị ala Igbo emeghi nkeọma' Onye odeakwụkwọ bụ Anthony Kanayochukwu Onwordi a na-akpọ Tony Kan ekwuola ka ndị na-achị ala Igbo tete n'ụra. Gere ihe okwuru n'uju n'ihe onyonyo a. Toni Kan bụ onye ode akwụkwọ ọnụ na-eru n'okwu Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ị ma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Kpalịte mmụọ m A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu ewere mkpụrụ Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri - ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri. Ihe nkịrị nke taa David Anyaele kọrọ ihe anya ya hụrụ n'obodo Sierra Leone mgbe ha na-alụ ọgụ. O kwuru na ebere ya aka nke mere na o jizi aka arụrụ e bi ndụ. 'E bere m aka maka na abụ m onye Naịjirịa' afirika-51127960,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51127960,Biafra at 50: Ihe ndị ụmụnwaanyị Igbo gabigara n'agha,"Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụnwoke so lụọ ọgụ Biafra, mana ahụhụ ụmụnwaanyị Igbo tara n'oge ahụ abụghị ihe e ji ọnụ akọ.",Ọtụtụ ka ogbunigwe gburu ụmụ ha n'ihu ha. Ndị ọzọ ka ndị agha wakporo n'ike ma metọọ ha. Lee ihe nkiri a ka ị nụ ihe ụmụnwaanyị hụrụ agha Biafra nwere ikwu maka ya. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chimamaka Ihenacho na Vining Ogu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: afirika-47580197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47580197,Onitsha Tanker Accident: 'A mapụrụ m na Keke bu anyị mana 'tanker' kwọgburu ndị m na ha so',"Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha.","Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Jackson kwuru na ya mapụrụ na 'Keke' bu ya, ka ọ hụrụ ụgbọala ""tanker ahụ"" mana ọ kwọgburu ndị ya na ya so. Chijoke Ojiugo si Abuja n'ala Enugwu mgbe ihe mberede zutere ya Chijoke Ojiugo sị Abuja na-ala Enugwu steeti maka akwamozu mama nnukwu ya oge ihe mberede ahụ jiri zute ya n'Upper Iweka. Ojiugo onye merụrụ ahụ n'ụkwụ kwuru na "" E sim Abuja bata na-aga maka akwamozu mma nnukwu m, amaghị ka ihe a si mee m hụ onwe ya n'ụlọọgwụ."" Lilian Nwankwo so na ọtụtụ ndị na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mberede ahụ mere Onye ọzọ bụ Lilian Nwankwo na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mere mberede ahụ kwuru na ""amaghị m ka o siri mee, e nwetara m onwe m n'ụlọọgwụ a."" Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a: Gọvanọ Anambara agaala ebe ihe a mere Aka na-chị Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ makana ihe mberede mere ebe a hụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrọ ka ndị Anambra na-ewe ịnshọransị ndụ maka udiri ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara ụnyahụ, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. Atiku tikwara ha aka n'obi N'ozi ya, Atiku Abubakar kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ. Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha. Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Jackson kwuru na ya mapụrụ na 'Keke' bu ya, ka ọ hụrụ ụgbọala ""tanker ahụ"" mana ọ kwọgburu ndị ya na ya so. Chijoke Ojiugo sị Abuja na-ala Enugwu steeti maka akwamozu mama nnukwu ya oge ihe mberede ahụ jiri zute ya n'Upper Iweka. Lilian Nwankwo so na ọtụtụ ndị na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mberede ahụ mere Onye ọzọ bụ Lilian Nwankwo na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mere mberede ahụ kwuru na ""amaghị m ka o siri mee, e nwetara m onwe m n'ụlọọgwụ a."" Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a: Gọvanọ Anambara agaala ebe ihe a mere Aka na-chị Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ makana ihe mberede mere ebe a hụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrịọ ka ndị Anambra na-ewe ịnshọransị ndụ maka udiri ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara ụnyahụ, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. N'ozi ya, Atiku kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ. Aka na-chị Anambara steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ n'ihi ihe mberede mere ebe ahụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrọ ka ndị Anambara na-ewe ịnshọransị ndụ maka udị ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara Tọzde, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. N'ozi ya, Atiku kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ. Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha. Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Jackson kwuru na ya mapụrụ na 'Keke' bu ya, ka ọ hụrụ ụgbọala ""tanker ahụ"" mana ọ kwọgburu ndị ya na ya so. Chijoke Ojiugo sị Abuja na-ala Enugwu steeti maka akwamozu mama nnukwu ya oge ihe mberede ahụ jiri zute ya n'Upper Iweka. Lilian Nwankwo so na ọtụtụ ndị na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mberede ahụ mere Onye ọzọ bụ Lilian Nwankwo na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mere mberede ahụ kwuru na ""amaghị m ka o siri mee, e nwetara m onwe m n'ụlọọgwụ a."" Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a: Gọvanọ Anambara agaala ebe ihe a mere Aka na-chị Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ makana ihe mberede mere ebe a hụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrịọ ka ndị Anambra na-ewe ịnshọransị ndụ maka udiri ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara ụnyahụ, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. N'ozi ya, Atiku kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ. Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha. Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Jackson kwuru na ya mapụrụ na 'Keke' bu ya, ka ọ hụrụ ụgbọala ""tanker ahụ"" mana ọ kwọgburu ndị ya na ya so. Chijoke Ojiugo sị Abuja na-ala Enugwu steeti maka akwamozu mama nnukwu ya oge ihe mberede ahụ jiri zute ya n'Upper Iweka. Lilian Nwankwo so na ọtụtụ ndị na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mberede ahụ mere Onye ọzọ bụ Lilian Nwankwo na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mere mberede ahụ kwuru na ""amaghị m ka o siri mee, e nwetara m onwe m n'ụlọọgwụ a."" Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a: Gọvanọ Anambara agaala ebe ihe a mere Aka na-chị Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ makana ihe mberede mere ebe a hụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrịọ ka ndị Anambra na-ewe ịnshọransị ndụ maka udiri ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara ụnyahụ, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. N'ozi ya, Atiku kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ. Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha. Tanka bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo opekata mpe mmadụ asaa n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde. Jackson kwuru na ya mapụrụ na 'Keke' bu ya, ka ọ hụrụ ụgbọala ""tanker ahụ"" mana ọ kwọgburu ndị ya na ya so. Chijoke Ojiugo sị Abuja na-ala Enugwu steeti maka akwamozu mama nnukwu ya oge ihe mberede ahụ jiri zute ya n'Upper Iweka. Lilian Nwankwo so na ọtụtụ ndị na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mberede ahụ mere Onye ọzọ bụ Lilian Nwankwo na-ebugharị ahịa n'ebe ihe mere mberede ahụ kwuru na ""amaghị m ka o siri mee, e nwetara m onwe m n'ụlọọgwụ a."" Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a: Gọvanọ Anambara agaala ebe ihe a mere Aka na-chị Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala ebe ihe mberede okporoụzọ mere n'Onicha ma kwuo na a ga-enyocha ihe kpatara ya. Obiano kwuru na ihe a metụtara ndị na-ebugharị ahịa n'isi ya mere o ji arịọ ka ndị mmadụ kwụsị ị bụgharị ahịa n'okporoụzọ. O kwukwara na ọ ga-eleba anya n'ihe gbasara etu ụzọ ebe ihe a mere si gbagọ agbagọ makana ihe mberede mere ebe a hụ n'afọ 2015 gburu ọtụtụ mmadụ. Obiano rịọrịọ ka ndị Anambra na-ewe ịnshọransị ndụ maka udiri ọdachi a. Cheta na site n'ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ depụtara ụnyahụ, na Obiano kwuru na ọ ga-akwụ ego ụlọọgwụ niile ebe ndị ihe mberede a mere na-anata ọgwụgwọ. Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi Buhari ekelel ndezinaụlọ ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ metụtara Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari na onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ha PDP bụ Atiku Abubakar atasiela Gọọmentị Anambara steeti nakwa ndị Anambara ndị ihe metụtara obi maka ihe mberede ụgbọala mmanụ ọkụ nke mere na steeti ahụ. Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ. Otu onye nọ oge ya bụ ihe mere, kwuru na ihe nwụrụ ruru iri atọ ma kọwaa na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede ahụ mere. Muhammadu Buharinwetara ohere ịchị agba nke abụọ dịka o merichara na ntuliaka 2019 N'ozi ya nke o wepụtara n'igwe ogwu Twitter ya Buhari kwuru na ""Ana m akasi ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ha na ihe mberede 'tanker' mere n'Ọnicha obi."" O kelekwara gọọmenti Anambara steeti na ndị Anambara ma kpe ekpere ka Chineke gba ndị mmadụ nwụnarịrị obi ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa. N'ozi ya, Atiku kwuru na ""ọ dị m obi mwute na ihe ruru mmadụ isii nwụụ ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ na mbere okporoụzọ mere n'Upper Iweka , Onitsha."" Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano ehiwere kọmiti nke kọmishọna na-ahụ maka njem nọ n'isi ya ga-enyocha ihe mere na mberede ahụ." afirika-53144473,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53144473,Ọgba mbọ: 'Akwụsịrị m ezigbo ọrụ m tinye isi kpam kpam n'isi nri n'ịntaneti',Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe na ọrụ adịghị n'obodo mana ndị ụfọdụ na-ahapụ ọrụ nke ha etinye anya n'ihe ka enye ha obi aṅụrị ma na-etinyekwa ego n'akpa ha.,"Winifred Nwaanya bụ nwata Igbo si Anambara steeti gwara BBC Igbo etu o siri malite aka ọrụ ya n'ịntanetị nke bụ Zeelicious Food. Nwada Nwaanya gwara BBC Igbo na ọ bụ oge ya na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi ka ya malitere aka ọrụ ya n'akụkụ. Mana o ruru oge o ruru, ya hapụzie ọrụ ya kpam kpam maka ya. Chọpụta etu o siri gaa. Ndị mere ihe nkiri a: Chimezie Uche Agbo na Nnamdi Agbanelo" afirika-57015519,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57015519,Harrison Gwamnishu: Ihe mere m ji enyere ndị a na-ebogide ebubo ụgha aka,Harrison Gwamnishu bụ nwaamadị sị na ya tara ahụhụ maka ihe ọ meghị.,"Ọ gara mkpọrọ maka ihe ụlọikpe mechere chọpụta na aka ya adịghị na ya. Mana tupu nke a emee, ọ pịala afọ anọ na ụma na mkpọrọ. Ka ọ pụtara, ọ mepere ụlọọrụ na-agbara ndị nọ na ụdị ọnọdụ ahụ ọgụ. Lee ka ya na ije si gaa." media-44020800,https://www.bbc.com/igbo/media-44020800,Nwodo: Ndigbo agaghị alụ agha nnwereonwe ọzọ,Onyeisi ọhanaeze bụ Nnia Nwodo ekwuola na Igbo agaghị alụkwa ọgụ nnwereonwe ọzọ kama ha na ndị agbụrụ nwere nkwekọrịta yiri ga-achịkọta site n'ụzọ mkparịtụka nweta nhaziharị Naịjiria na mpaghara na ọnọdụ dịka ebunobi ndị nna anyị ha bidoro ala anyị si chee ya.,"Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Nwodo kwuru nke a n'Enugwu n' ọgbakọ, 'Nkata Ụmụ Ibe' nke mbụ nke Centre for Memories hiwere. O kwuru na ndị mpaghara ndịda n'etiti Ugwu-Awụsa ga-atụnyere naanị onye na azọ ọkwa onyeisiala onye pati ya kwere nkwa na ha ga-ahazigharịa Naijiria na mpaghara. ""N'echiche anyị, ọgụ ọbụla a ga-asị na ọ bụ sọ Ndigbo ga-alụ ya aghaghị adị ire ka nke anyị na ndị ọzọ kwekọrịtara na ihe ndị nnanna anyị ha nwere ka na 1963 nke agha gbosara nke mere ka ala anyị bụụ otu ngalaba ma meekwa gọọmenti etiti ka ọ bụrụ Onyejiikeniile."" O kwukwara sị, ""Anyị na-agba mbọ na-ekwu na onye ọ bụla chọrọ ịchị Naịjirịa n'afọ 2019, na nhazigharị Naijiria na mpagahara na mpaghara (restructuring) ga-eso na nkwupụta nke pati ya. Anyị agaghị atụnyere onye ọbụla achọghị nhazịharị na mpaghara."" Onye ọbịa pụrụiche na ọgbakọ ahụ bụ guest speaker, Prof. Chidi Odinkalu, onye kwuru maka ""Igbo Ekunie: I he mmụta dị na ọgwọgwọ mere ka alụchara agha"" tụrụ arịrị na gọọmentị etiti etinyeghị ego na imezu atụmatụ mkpezi, nhazig na ịnabatagharị Ndịigbo ka alụchara Agha. Odinkalu kwupụtara mkpa ọ dị inyere ndị ntorobịa Igbo aka inwe nka and ịgba mbọ ma chọ ụzọ ha na ndị ọzọ nọ n'ala Naijiria ga-esi na-ebikọ maka akụnaụba. Akụkọ ga-amasị gị" 47231625,https://www.bbc.com/igbo/47231625,Anthony Joshua ga-ezute Jarrel Miller n'asọmpi,Anthony Joshua na Jarrel Miller ga-asọ mp i,"Akụkọ dị mkpa: N'egwuregwu, Nwafọ Naijiria na-agba mgba n'aha mba Briten bụ Anthony Joshua ga-alụ ọgụ ya mbụ na mba Amerika oge ya na Jarrel Miller ga-ezute na Madison Square Garden maka ịzọ ikike ya dịka ọkaibe na mgba n'ụwa niile, n'abalị mbụ. Agbakoba akatọọla iwu e nyere ka anwụchie Onnoghen Justice Walter Onnoghen Onye bụbu onyeisi otu jịkọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa (NBA) bụ Olisa Agbakoba akatọọla iwu ụlọikpe pụrụ iche a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal (CCT)' nyere ka a nwụchie ọkaikpe Onnoghen. N'ụbọchị Wenezde, onyeisioche tribunal bụ Danladi Umar nyere iwu ka anwụchikọ Onnoghen n'ihi na ọ bịaghị n'ụlọikpe. Mana n''akwụkwọ ozi o wepụtara, Agbakoba kwuru na ""CCT kwesịrị ichere mpụtara ikpe gbasara okwu ahụ nke ka nọ NJC, ụlọikpe mgbegharị nakwa ụlọikpe ukwu nke etiti"" Ọ kọwara na agwa megidere usoro ịgbaso ihe dịka o siri kwesi. Umahi,Ohaneze asaala Nnamdi Kanu Aka na-achị Ebonyi steeti ma bụrụkwa onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi nakwa onye ndu otu Ohaneze bụ Nnia Nwodo agọọla ebubo Nnamdi Kanu boro ndị gọvanọ Igbo na ha bụ ndị kpara mkpata ka ha gbuo ya. Ha kwuru na ebubo ahụ bụ asị kpụ ọkụ na ọnụ n'ihi na ọ bụ aghara Nnamdi Kanu kpara mere ka ndị agha Naijiria wakpo ụlọ ya n'oge Egwu Eke. Mmadụ 15 nwụrụ n'achụmta vootu APC na Pọtakọt Ụlọọgwụ 'University of Port Harcourt Teaching Hospital"", (UPTH) ekwuola na ọ bụ mmadụ 15 nwụrụ n'ọgbọegwuregwu Adokiye Amiesimaka, ka otu 'All Progressive Congress"" (APC) mere achụmnta nke ọkwa onyeisiala n'abali iri na abụọ nke ọnwa Febrụwarị, 2019. Ndị nwụrụ gụnyere ụmụnwaanyị iri na abụọ na ụmụnwoke atọ. Zimbabwe chọrọ iwepụ iwu megitere mgbasaozi Ndị imeobi gọọmenti mba Zimbabwe ekpebiela iwepu iwu megidere ndị ọrụ mgbasaozi nke e ji nwụchie ndị ntaakụkọ ma mechikwa ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ oge ọchịchị Robert Mugabe. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-48652546,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48652546,Argetina vs Columbia: Ndị nso nso kpụ Lionel Messi n'ọnụ maka asọmpị a,Ndị madụ ejirila ọchị na njakịrị merụọ Lionel Messi ahu dịka ndị otu bọọlụ Columbia jiri ha mee ihe egwuregwu ka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu were merie ndị otu bọọlụ Argentina.,"Emeriri otu egwuregwu Argentina na mmepe asọmpị Copa America 2019 Colombia yiri Argentina egwu dika Roger Martinez na Duuvan Zapata nke columbia jiri goolu otu otu were sị ha ""ka emesia"". Ndị madu banyere twitter ikwa Lionel Messi emu. @Wenko_De_Welco kwuru na ọdịda esighị Messi n'aka. End of Twitter post, 1 @llsteve20 kwuru na onye ụta dịrị bụ Ousmane Dembele. @TheYBuhari na-ajụ onye a ga-ebo ọdịda Argentina n'isi? @ahmerdrufai kwuru na Messi emereghị n'egwuregwu bọọlụ iri ọgbarala n'ime bọọlụ iri na atọ n'izu a Ha mere nke a n'ihi na ha turu anya na dịka onye soro na otu bọọlụ Barcelona ndị buru Iko La Liga ma kwa dịka onye kacha nye Goolu na ya bu Messi kwesiri ime ka ndị otu ya merie. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48285342,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48285342,Kano Emirate: Ndị gọvanọ a na-etinye anya n'ịhọpụta eze ọdịnala?,Akụkọ na ụlọomeiwu Kano Steeti ochịchị ocheeze kachasị na Naịjirịa bụ 'Kano Emirate' n'ime ụzọ ise ebutela arụmụka dị iche iche n'etiti ndị Naịjirịa dịka ụfọdụ na-ekwu na atụmatụ abụ iji kpaa Emir Muhammadu Sanusi nku n'ihi ikike e che na onwere na n'ebe gọọmentị steeti ahụ nọ.,"Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir Akụkọ banyere Ocheeze Kano malitere kamgbe narị afọ iri na ise, nke jupụtara n'agha jihad nakwa mmeri dị iche iche, kamgbe afọ 1903, Kano enweela udo n'obi ọchịchị. Mgbe ụfọdụ, a na-echi mmadụ Emir mgbe onye nke ji ọkwa ahụ nwụrụ. Kano nwere okpuruọchịchị dị 44 nakwa ọnụọgụgụ mmadụ dị nde 9, nghazigharị ikike ocheeze Emir nwere ga-ahụta ga-eme ka okpuruọchịchị otu Emir nwere bụrụ zie iri. Nghazigharị nke ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ ụjọ ga-emebi ikike ọchịchị Emir na steeti ahụ. End of Twitter post, 1 Iwu a ụlọomeiwu Kano wepụtara nakwa aka gọvanọ ha bụ Abdullahi Umar Ganduje tinyere na ya n'ụbọchị Wednezde 8 Mee, ọchịchị Emir nke Kano nke kaịrị afọ narị abụọ, ahụtala mgbanwe ọhụrụ. Iwu a ga-eme ka Emir nke Kano Muhammdu Sanusi bụ otu n'ime ndị eze kachasị pụta ihe na Naịjirịa nwere zie naanị otu n'ime ụzọ ise ekere obi ọchịchị ya. Ekewapụtala oche eze anọ ọhụrụ bụ nke ga-enwe ndị Emir nke ha. ""Ọchịchị nwa bekee emetụghị ọchịchị Kano aka etu e ji metụ ya aka n'ụbọchị a"" dịka ọkanmụta Tijjani Naniya nke ngalaba akụkọ na Mahadum Bayero dị na Kano. Ọ kọwara nkewapụta obi ọchịchị ọhụrụ dịka mmetọ akụkọ ndị bụ nke e kwesighi ịnabata ka ọ kwụrụ. Emir Ado Bayero nke nwụrụ anwụbụ nwanne nna Emir Muhammadu Sanusi II Gọọmentị Kano Steeti na-ahụta ya n'ụzọ ọzọ. N'ozi ha wepụtara, ha kwuru ""mkpebi ikesa ọchịchị eze bụ iji bute mmụta omenala bịa nso n'ebe ndị obodo nọ"". Ọkanmụta a kwuru na o kwere na atụmatụ ikewa ọchịchị eze ụzọ ise agaghị anọte aka dịka gọvanọ Abubakar Rimi chiburu Kano nwara ya n'afọ 1982 mana ọ mara afọ n'ala na-erughi otu afọ. Kano bụ isi obodo azụmaahịa na mpaghara ugwu nke Naịjirịa Abdullahi Sani bụ onye bi na Kano kwuru na ọ dị afọ iri anọ na ọ bụkwa ọchịchị eze Kano ka ọ mara ma hụkwa n'anya dịka ọ na-etolite. Saifullah Mukhtar onye ọzọ bi na Kano na-anaghị ahụcha ụzọ kwuru na atụmatụ a dị mma dịka ihe gbasara ndị obodo ga-abụ ihe a ga-ekwu na gburugburu ebe ha na-abụghị ilekwasị anya na Kano dị anya tupu e mee mkpebi. Oche eze Kano nwere onwe ya site na ọchịchị Sokoto n'afọ 1903 N'Agbanyeghi na akwụkwọ akụkọ kwuru na ụlọikpe ukwu dị na Kano nọrọ n'ụbọchị Fraịde nye iwu ga-akwụsị ikewa ọchcịchị eze, Gọvanọ e nyela ha ikike ọchịchị na Mọnde. N'ime ihe niile a, ọ ga-adị mma ka a mata na Kano abụghị Steeti mbụ ụdị ihe a eche na ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi eze na-eme na nso nso a. IMO STEETI N'afọ 2015, Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo State, Ọwụwanyanwụ, Naịjirịa na Eza ndị Owerri nwụrụ anwụ bụ Eze Emmanuel Emenyonu Njemanze, OzuruIgbo nke ise Owerri nwere ụdị esemokwu a bụ nke Eze a boro Gọvanọ ebube ikewa Owerri nakwa steeti niile. Gọvanọ Okorocha zọrọ ọkwa Sịnetị n'afọ 2019 dịka ọ chịzuru afọ asatọ n'ọkwa N'ime esemokwu dị n'etiti ha abụọ, a sị na ọchịchị Okorocha gbara mbọ ịhụ na a kwụsịrị Eze Njemanze ọrụ dịka osote onyeisioche ndị Eze na steeti ahụ, n'ihi nkwado a sị na o nwere n'ebe Eze Cletus Ilomuanya nọ, onye achụpụrụ dịka onyeisioche ndị Eze ọdịnala na Imo Steeti. Gọọmentị steeti gọnarịrị ebubo a ma kwuo ""Na aka ya adịghị na ọchụchụ a chụrụ ndị Eze anọ nakwa nyocha a na-eme mmadị iri ise ọzọ n'aka otu jikọtara ndị eze""...Mana gọomentị agaghị egbu oge ime ihe ọbụla otu jikọtara ndị eze kpebiri dịka ọ ga-abụ ihe ga-eme ka Steeti dị mma..."" Eze Njemanze chịrị afọ iri abụọ na asaa rue mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2016 dịka ọ gbara afọ iri asatọ na anọ Dịka o si mee na Kano, ọchịchị Okorocha kewara obi ọchịchị Eze a n'ime obodo ise nke nwere Eze ha n'otu n'otu. Taa, Imo Steeti nwere obodo dị 637 nwere Eze ọdịnala nke ha, nke a sị na ọ bụ Gọvanọ Okorocha nyere ha ọkwa ọchịchị. OYO STATE Na mpaghara ndịda nke Naịjirịa, Oyo Steeti na nso nso nwere ụdị ndọrọ ndọrọ a n'etiti Oba Saliu Adetunji, Olubadan nke Ibadan na Gọvanọ Abiola Ajimobi. Gọvanọ Ajimobi dara n'izọ ọkwa Sịnetọ ga-anọchi anya mpaghara Oyo South n'afọ 2019 dịka ọ chịchara ugboro abụọ dịka gọvanọ N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017, Ajimobi buliri ọkwa ndị isi obodo dị 21 (Mogajis) nakwa ndị akpọrọ Baales, ma mee ha ndị Oba; nke mere ha ndị Eze zuruoke. Na mgbanwe ọhụrụ a, Olubadan bụ Eze kachasị n'Ibadan ga na-aza 'His Imperial Majesty', onyeisi ya kachasị e mere Oba ga na-aza 'His Royal Majesty' ebe ndị Baale, ga-abụ 'Your Royal Highness'. Oba Adetunji Olubadan nke iri anọ na otu e chiri ya n'afọ 2016 dịka ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ Ndị nkatọ sị na Gọvanọ e mebiela omenala inwe otu Oba n'etiti ọtụtụ ndị isi obodo n'ihi ọkwa ọhụrụ ndị a o nyere. N'aka nke ọzọ, gọvanọ siri ọnwụ "" Onweghi omenala na akụkọ obodo ndị Ibadan anyị na-agbanwe kama anyị na-akwadosi ike ma na-ewulite omenala anyị."" Olubadan a mara gọvanọ aka n'ụlọikpe ma gbalịa ka o wepụ mkpebi ahụ. Onye ọzọ katọrọ agwa Gọvanọ Ajimobi kpara bụ onye bụbu gọvanọ Oyo Steeti bụ Alhaji Rasheed Ladoja, onye bụkwa Mogaji ebugoro n'ọkwa Oba mana ọ na-abataghị ya ma katọọ ọkwa ahụ. kwuo, ""... Agaghị m abụ Oba na-enweghi obi ọchịchị."" N'ọnwa Jenụwarị afọ 2018, Ụlọikpe ukwu dị n'Oyo Steeti chabiri ikpe ma kwuo na atụmatụ Gọvanọ Ajimobi ""ezighi ezi, iwu akwadoghi ya, na ọ bụ ihe efu."" Gọvanọ eburula ikpe a gaa n'ụlọikpe mkpegharị." afirika-49725362,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49725362,Economic Advisory Council: 'Ihe mbụ ha ga-eme bụ ịgwa Buhari ebe ọ dajọrọ - Ezekwesili,"Oby Ezekwesili etoola onyeisiala Muhammadu Buhari maka ihiwe ngalaba ndị ndụmọdụ nhazi akụnaụba nke ndị ọkachara mara n'okwu akụnaụba so n'ime ya ma rịọ ndị ọ họọ ọrụ ka ha gwa ya eziokwu na ""ọ kụdara akụnaụba Naijiria n'afọ anọ gara aga.""","Economic Advisory Council: Ugbua ka Buhari biara - Ezekwesili Na mbido izu a, Buhari hiwere otu ndụmọdụ ọhụrụ maka akụnaụba a kpọrọ 'Economic Advisory Council' nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo na onyeisi 'Financial Derivatives Co. Ltd' bụ Bismark Rewane, so na ya. N'okwu o depụtara n'akara 'Twitter' ya, Ezekwesili, kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị a ụbụrụ ha na-acha ọkụ Buhari họrọ n'ọrụ ""hapụ ikpọ isi ala na ndị otimkpu, gwaa Buhari nke bụ eziokwu nke ọ ga-abụ a gbasoo ya, akụnaụba Naijiria agawa n'ihu"". Ezekwesili, onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ngalaba nhazi mmefu ego na gọọmenti a kpọrọ 'Due Proces', kwuru na nhọpụta ọhụrụ a chịkọtara ihe atọ; 1. Ndị ọchịchị kachasị 2. Ndị ọkachamara imeụlọ 3. Nakwa ndị ụburu ha na-achọ ọkụ n'o n'ama, ọnụna ndị ụbụrụ Ezekwesili gara n'ihu gwa ndị na-ata osote onyeisiala Yemi Osinajo ụta maka etu akụnaụba Naijiria siri kpụọ afọ n'ala na ọbụghị Osibanjo nyụrụ ihe na-esi. Otu a bụ nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo so na ya ga-anọchi anya otu Economic Management Team nke osote onyeisiala Osinbajo bụbu onyeisioche ya. Onyeisioche otu a bụ ọkammụta Doyin Salami, ndị ọzọ bụ Mohammed Sagagi osote onyeisioche, Shehu Yahaya, Iyabo Masha, Bismark Rewane, Mohammed Adaya Salisu. Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi sị na ndị a ga-enye onyeisiala ndụmọdụ banyere ime iwu akụnaụba Naịjirịa. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ Ndị uweojii kwere nkwa na aka ha ga-akpara ndị na-arụ ala ahụ Ndị uweojii na Port Hacourt anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Potakọt. Na nsonso a, a tọgburu opekatampe ụmụagbọghọ asatọ na ndịda Naịjirịa kemgbe ọnwa Julai. N'otu aka ahụ ndị uweojii kwukwara na akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ ọzọ atọgburu n'ụlọoriri abụghị eziokwu Ha kwuru nke a dịka ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọbịa n'ụlọoriri n'obodo ahụ. Ọsọ Saụt Afrịka Chairman /CEO, Nigerians In Diaspora Commission, Hon Abike Dabiri-Erewa Ụgboelu Airpeace kwesiri ịga bulata ụmụ Naịjirịa ọzọ site na mba Saụt Afrịka na mgbede taa bụ Tuzde efenyighizi oge a tụrụ anya n'ihi Saut Afrịka enyeghị ha ikike ifebata. Mana Onyeisi Airpeace Allen Onyema gwara BBC na ha enwetala ya bụ ikike nakwa na ha ga-aga mba Saut Afrịka nata n'ụbọchị Wenezde. N'ofesi, Peter tabichi bụ onye nkuzi Kenya ritere nzere ""onye nkuzi ọkaibe na mbaụwa na 2019 "" ezutela onyeisiala mba Amerịka bụ Donlald Trump n'obi gọọmentị mba ahụ Tabichi onye chiri Franciscan Brother' na-eji pasentị iri asatọ n'ụgwọ ọnwa ya akwado ụmụakwụkwọ ya N'egwuregwu, Otu ICPC ejichiela akụnaụba Amaju Pinnick na ndị ọrụ NFF ndị ọzọ dịka ha na-enyocha ha maka nrụrụaka Rasheedat Okoduwa na-ekwuchitere ICPC kwuru a na-enyocha ndị a n'ihi na ihe ndị ha nwere karịrị ụgwọ a na-akwụ ha. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Gọvanọ Ugwuanyi agbapela okporoụzọ ọhụrụ Ifeanyi Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu steeti Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agbapela okporoụzọ si Ikem gawa Eha Amufu nakwa Nkalagu dị n'okpuruọchịchị Isi-Uzo Enugwu steeti. Okporoụzọ a dị kilomita asatọ na ụma bụ ebe e si a ga n'ụlọọrụ Sịmentị Naịjirịa bụ Nigercem nakwa gawa mpaghara ugwu. N'ofesi: Mba Izrel na-eme ntuliaka ha nke ugboro abụọ n'ime ọnwa ise ebe Pati ndị kachasị obere nwereike ikpebi ihe ga-eme. Onyeisiala ha Benjamin Netanyahu kpọrọ oku ka e me ntuliaka ọzọ makana ọ hụghi ndị ya na ha ga-eso hazie gọọmentị dịka o merichara ntuliaka n'ọnwa Eprel N'egwurgwu Manchester City, Cristiano Ronaldo, Lionel Messi, Ajax, RB Leipzig and Liverpool (site n'aka ekpe ruo n'elu aka nri) Asọmpi bọọlụ kachasị na Yurope bụ Uefa Champions League nke afọ 2019/2020 ga-atabiri ọkụ taa n'elekere asatọ nke abalị a. Cheta na otu egwuregwu Liverpool maburu iko asọmpi a n'afọ gara aga. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Toilet Posture:Lee ka ị ga-esi ga mposi ọfụma na-achịghị nsị" 42843442,https://www.bbc.com/igbo/42843442,Buhari emela ndị omeiwu omee-abughịnso,"Onye enyemaka onye isi ala na ihe gbasara ụlọ ọmeiwu, bụ Senitọ Senator Ita Enang,gwara ndị nta akụkọ nke a n' ụbọchị ịrị abụọ na isii ka onye isi ala tinyechara aka na iwu ndị a.","Ọchịchị onye isi ala Naijiria bụ Buhari na-ebu agha megide mpụ Iwu a nke akpọrọ, ""Iwu ike na ohere nke ụlọ omeiwu nke afọ 2018"" na-enye ndị omeiwu nke steeti na gọọmenti etiti nchekwa ka a ghara igba ha akwụkwọ maka ihe ha kwuru maọbụ mee oge nnọkọ ha na-aga n'ihu. Iwu ahụ bụ otu n'ime iwu asatọ nke onye isi ala tinyere aka n'ime ya mere ka ikike ndị omeiwu nwere ịkpọ onye masịrị ha oku na inye iwu ka anwụchiee onye dara iwu ahụ. Iwu ndị ọzọ Buhari tinyere aka gunyere; iwu mebere the National Institute of Legislative Studies (Amendment) Act, 2018 maka ọzụzụ ndị omeiwu, iwu maka nkwekọrita ikwusi Ina ụtụ isi ugboro abụọ, dị na etiti Naijiria na mba Spain na iwu mebere otuChartered Institute of Project Managers of Nigeria (Establishment) Act 2018; iwu na-ahụ mak ndị okenye ana akpọ ""National Senior Citizens Center Act, 2018,." afirika-44023442,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44023442,Ọkụ ụgbọala agbagbuola ndịuweojii ise nọ n'ọzụzụ,Ihe ruru mmadụ ise bụ ndịuweojii nọ n'ọzụzụ (nke bekee kpọrọ cadet) anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ.,"Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha. Onye otu ha a kpọrọ @cadet_suhail mara ọkwa ọnwụ ha na Twitter ka o kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee. O kwuru sị ka ndị mmadụ tinye ha n'ekpere. End of Twitter post, 1 O mechara kwuo na otu n'ime ha bụ onye nke mezuru ha mmadụ ise, nwụrụ n'ụlọọgwụ. O gosikwara ụgbọala ha gbara ọkụ. Lee ihe otu n'ime ha dere tupu ọ nwụọ: Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa" 42696301,https://www.bbc.com/igbo/42696301,'A na m ahapụ akwụkwọ iji chute ezigbo mmiri',Mario Macilau dị afọ iri abụọ na atọ (23) oge o gbanwere ekwenti nne ya iji gote ose foto Nikon. Ise foto abughịrị ihe ọhụrụ maka na o bidoro oge ọdị afọ iri na anọ sewe foto gbasara ndụ ndi obodo ha bụ Maputo dị n'isi obodo Mozambique.,"Macilau na-ese foto ọtụtụ ihe O sela ọtụtụ ihe ndị ọọ bido n'ụmụaka nọ n'okporo ụzọ nakwa ndị ọrụ simenti na mba ahụ. Ugbu a, o burula ose foto ya che ebe okwu mmiri dị. Foto ndị a e sere na ngwụcha afọ 2017 sitere na-enyemaka ndị otu a na-akpọ WaterAid maka ọrụ ozi ha na-arụ rue ngwụcha ọnwa a bụ Jenuwarị. Bido ugbu a rue afọ atọ na-abịa, Macilau ga-edekọ mgbanwe mere n'obodo ndị dị n'akụkụ Cuamba dị na Mozambique dịka ha nwetara ezigbo mmiri nakwa ebe mkposi. Ụmụaka Maputo Ụkwụ ha na-egosi udi njem ha mere ichuta mmiri Josefina na Eudicia na-aga akwụkwọ nanị otu ụbọchị maka mmiri Josefina na Eudicia, ha abụọ dị afọ iri na abụọ, ọ na-ahapụ akwụkwọ ihe ruru ugbo anọ n'izu iji chuo mmiri. Ha na-eji ụkwụ aga Rio Naranja, iyi na-asọpụta n'osimiri Muassi, nke bụ isi ebe obodo Muassi na-enweta mmiri. Iyi ahụ ahụ anaghị asọpụ asọpụ, nke a kpatara na mmiri ha na-echute na-acha ka mmiri ara dịka Macilau siri kwuo WaterAid kwuru na otu nime nwatakịrị nọ n'ụwa enweghi ezigbo mmiri n'akụkọ ụlọ ha ebe ha enweghikwa ezi ebe mkposi. kwa ụbọchị, ihe ruru ụmụaka narị asatọ na-erughi afọ ise na-anwụ site n'ọya afọ ọsịsa nke ajọ mmiri na gburugburu na adịghị ọcha na-akpata. Ha na-arị ugwu iji chute mmiri Inweta ezigbo mmiri bụ nnukwu nsogbu na mpaghara Afrịka Ụlọ mmiri ozuzo kwaturu Ihe ndị na-asọba na mmiri N'oge mmiri ozuzo, mmiri Lurio na-adị njọ nke ukwu n'ihi na atịtị ndị dị na gburgburu ebe mmiri ahụ dị ga-asanye na ya kpatara na-agahị anụ ya anụ. N'obodo M'mele, mmiri ozuzo kwaturu otu ụlọ aja ụpa afọ atọ gara aga. Onye isi ndị obodo ahụ kwuru na ndị mmadụ na-akwapụ n'obodo ahụ maka nsogbu mmiri ahụ. Foto onye oru ugbo kara nka ajo mmiri wuru Angelina na nwa ya nwaanyi Irene na sosona Masel Elisa Piassone na Zaida na-aga n'ụzọ dị n'etiti M'mele na Kimar dịka ha na-ebuga ntụ ọka" afirika-49310418,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49310418,Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ,"Anụ bụ otu n'ime ihe ndị dị mkpa na nri mmadụ na-eri ma na-enye akụrụngwa ndị dịka 'protein', abụba na mmiri n'ahụ mmadụ.","O nwere obi ụtọ pụrụiche ndị mmadụ na-enwe ma anụ dị na nri ha na-eri, ọkachasị anụ gbara ọkpụrụkpụ. N'ihe onyonyo a, ndị mmadụ kọwara ihe mere ha ji ata anụ ma ha richa nri kama ịta ya tupu mọabụ dịka ha na-eri nri. Kirie ihe kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53843282,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53843282,Mali coup: A họpụtala Bah Ndaw dịka Onyeisiala mba Mali nwa mgbe nta,Mba Mali enwetala onyeisi nwa mgbe nta bụ Bah Ndaw.,"Ndaw, onye bụbu Minista Nchekwa bụ onye isi dị agha weghara ọchịchị na mba ahụ bụ Colonel Assimi Goita, họpụtarala ka o jide ọchịchị ma hazie ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ọnwa iri na-asatọ na-abịa. Goita ga-abụ osote Ndaw bụ onye ofe ụgbọelu larara ezumike nka. A na-atụ anya na nhọpụta ya ga-eme ka Ecowas wepụ ntarahaụmụhụ ha tinyere Mba Mali maka ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ. Ụkọ ngwaahịa mere azụmahịa kụọ afọ n'ala na mba Mali dịka Ụlọikpe Ecowas nọ n'Abuja nọọ n'ehihie Fraide(sept 25,2020) kụchapụrụ akwụkwọ nke otu abụọ na Mali gbara maka ntaramahụhụ nke otu Ecowas nyere mba ahụ n'ihi nchutu ndịagha chuturu onyeisiala ha. Ndịisi agha nọ n'ọchịchị Mali na ndịisi Ecowas na-enwe ọgbakọ taa Osote Onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo awuchiela mba Gana maka ịnọchite Onyeisiala Muhammadu Buhari n' ọgbakọ dị n'etiti ndịisi mba dị na Ecowas na ndị isiagha weghara ọchịchị n'ike na mba Mali na Gana. Osote onyeisiala Naịjirịa na nzụkọ ndị Ecowas Cheta na ndị agha mba Mali weghara ọchịchị n'ike n'aka Ibrahim Boubakar Keita, bụbụ Onyeisiala mba Mali n'ọnwa Ọgọstụ. Ecowas anabataghị nkwa inyeghachi ọkwa ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ atọ nke ndị agha ahụ kwere, ebe ndị agha ahụ achọghịkwanụ inyeghachi Keita ọkwa ahụ dịka Ecowas si chọọ. Ibrahim Boubakar Keita, Onyeisiala mba Mali e nyere ọsọ nọ n'ụlọọgwụ Ibrahim Boubakar Keita Ibrahim Boubakar Keita bụbu onyeisiala mba Mali tupu ndị agha mba ya achụpụ ya n'oche, nọ n'ụlọọgwụ kemgbe ụbọchị Tuzde. Mamadou Camara bụbu onyeisi nchịkọta ndị ọrụ ya gwara Abdoula Karim Ba bụ onye ntaakụkọ BBC nke a n'ụtụtụ Wenezde, Septemba 2. Camara kwuru na ọ nọ n'ụlọọgwụ dị n'isiobodo Bamako, kwuru sị ""Onyeisiala Keita gara nlekọta o kwesịrị ịga kemgbe otu ọnwa gara aga, mana e nyere ya akwa ka o wee ghara ịla"". O kwukwara na ọ bụ dọkịta Keita kwuru kaa ọ nọrọ ka e lekọta ya, na ọ gaara esikwa n'ụlọọgwụ lawa n'ime otu ụbọchị ahụ. Otu onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu nso Keita kwuru sị na ọ ga-esikwa na mba ahụ pụọ ịga nweta nlekọta na mba ọzọ n'oge na-adịghị anya. Cheta na ndịagha chụpụrụ Keita n'oche ọchịchị n'izu ụka abụọ gara aga. Ecowas, Buhari enyela ndị agha mba Mali ọnwa iri na abụọ iji hafee ndị nkịtị ọchịchị Ecowas nwere ọgbakọ gbata gbata maka mba Mali n'Ịntaneetị Otu jịkọrọ mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ 'Economic Community of West African States' (Ecowas) agwala ndịagha mba Mali ka ha hazie ntuliaka ma hafee ndị nkịtị ọchịchị n'ime otu afọ na-abịa abịa. Nke a bụ nkwekọrịta ha nwere n'ọgbakọ gbatagbata ha mere n'ụbọchị Fraịde, nke onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari sonyere na ya. N'ọgbakọ ahụ, Buhari gwara ndịagha Mali ka ha buru ọdịmma ndị ha na-achị n'obi ma hapụ ịchọ naanị ihe ga-adị ha onwe ha mma. Buhari kwuru sị: ""Ọ gaghị adị mma ka mba Mali nọrọ naanị ya. Nke a mere o ji dị mkpa na ha ga-agba mbọ wepụta atụmatụ ha ga-eji hafee ọchịchị n'aka ndị nkịtị ma banyekwa ọchịchị onye kwuo uche ya."" ""Nke a bụ ihe ga-akara Mali nakwa Ecowas mma."" Buhari rịọrọ ndịisi ndịagha Mali ka ha gbado anya n'ichekwa obodo ha karịa itinye anya n'ọchịchị. Ọ gara n'ihu kwuo sị: ""Ana m arịọ ndịisi ndịagha ka ha tọhapụ ndị ọchịchị niile ha ji eji n'egbughi oge ọbụla."" ""Ha gbakwaa mbọ malite usoro ịhafe ọchịchị n'aka ndị nkịtị, nke a ekwesịghị ịgafe ọnwa iri na abụọ."" ""Naịjirịa na Ecowas ga-enye aka iweta ihe niile dị mkpa a ga-eji mee ntuliaka na Mali ma weghachi ọchịchị onye kwuo uche ya."" Goodluck Jonathan gara obi gọọmenti dị n'Aso Rock na nsonso a ịkọwara onyeisiala Muhammadu Buhari maka ije ya na Mali Lee ihe ndị Ecowas na ndị agha Mali kwekọrịtara Cheta na otu Ecowas wepụtala mpụtara nzụkọ abalị atọ ha na ndị agha were ọchịchị n'ike na mba Mali nwere. Dịka Ecowas si kwuo, ndị agha ahụ chọrọ ka enye ha ohere afọ atọ maka iweghachi ọchịchị n'aka ndị nkịtị nke ha chọrọ ịhazi afọ atọ fọọrọ onyeisiala ha chuturu n'ọchịchị bụ Ibrahim Boubacar Keita. Ndị aha ahụ kporo oku ka e nwee Praim Minista nakwa onyeisiala ọhụrụ ndị agaghị enye ohere ịzọ ọkwa n'afọ 2023. Ọtụtụ ndị Mali nabara nchụda nIbrahim Keita Akụkọ kwuburu na ndị agha ahụ atọhapụla Praim Mịnịsta bụ Boubou Cisse nakwa onyeisi ụlọomeiwu bụ Moussa Timbine bu ndị so na mmadụ 19 ndị ọrụ gọọmenti a jichiri kemgbe abalị 18 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2020. Ụnyaahụ bụ Tọzde, ndị agha a tọhapụrụ Keita bụ onye ha jibụ eji. Ntọhapụ Keita so na ọnọdụ otu Ecowas nyere ha ha ga-eji wepụ mmachi ha machiri Mali. Ndị agha ahụ bụ ndị kwuru nke a na Facebook sị na Keita nọzị n'ụlọ ya ka ọ dị ugbua. O dobeghị anya ma ha asị Keita esila na be ya pụọ. Ịtọhapụ Keita bụ ihe kacha mkpa ndị agbataobi, ndị mba ofesi na African Union nakwa ogbo ha nke ndị Europe. Ndịagha Mali ekwebughị ka a kpọghachi Keita dịka onyeisiala ka Ecowas si chọọ Mkparịtaụka e mere na mba Mali maka idozi okwu na mba ahụ dịka ndị agha weghachara ọchịchị n'izuụkaz hara aga ebilea na enweghị nkwekọrịta ọbụla Ndị ndu mba dị ga n' Ọdịda-Anwanwụ Afrịka chọọ ka ndị agha nyeghachi ọchịchị n'aka onyeisiala ha chụtuburu bụ Ibrahim Boubacar Keïta. Mana ndị agha ahụ ekwenyeghị na ihe ndị nnọchiteanya si Ecowas gụnyere Goodluck Jonathan gwara sị na ọ bụ ụzọ kachasị mma ibi ya bụ okwu. E mere ngagharịịwe kpụ ọkụ n'ọnụ tupu a chutuo Keïta n'ọkwa onyeisiala, ebe ọtụtụ ndị ala ahụ nabatara nchụda a chụdara ya. Ọnụ na-ekwuru ndị agha na mba ahụ gwara bụ Col Ismael Wague gwara ụlọakụkọ Reuters ka e emechara mkparịtaụka ahụ na ọ bụ ndị Mali ga-ewu ndị ga-achị ha. Lee ndị isiagha kpara nkata iweghara ọchịchị n'ike na mba Mali Ndịagha kpara nkata 'coup' na Mali E ji n'aka na ị nụla na ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'otu United Nations enyela ndị agha mba Mali iwu ka ha wepụ aka n'ọchịchị mba ahụ ha weghaara n'ike. Nke a na-abịa dịka otu Afrịka Union nakwa otu Ecowas katọrọ nchutu ndị agha mba Mali chuturu onyeisiala mba ahụ bị Ibrahim Boubakar Keita nakwa Praịm Mịnịsta bụ Boubou Cisse. Ndị 'UN Security Council' kpọburu oku ka ndị agha ahụ tọhapụ Keita, Cisse na ndị ọzọ niile ha ji eji, ma laghachi n'ogige ha N'egbughị oge. Ọtụtụ ndị ọchịchị na mba dị icheiche katọrọ mweghara ọchịchị nke ndị agha weghaara na mba Mali. Ha kwuru n'oge agaala mgbe ndị agha na-eji egbe nakwa iyi egwu eweghara ọchịchị. Mana ị ma ndịagha kpara nkịta ahụ ghọrọ ngịga? Ndị agha kpara nkata ịchutu Keita 1) Col.Malick Diaw Malick Diw bụ osote onyeisi ogige ndị agha mba ahụ nke dị na Kati Camp. Enweghị ọtụtụ ihe a ma maka Diaw. Kama ọ bụ nsonso a ka o si mba Rụshịa lọta ebe ọ gara ọmụmụ. 2) Gen Cheick Fanta Mady Dembele Ọ gara mahadum na Saint-Cyr military Academy nke dị na mba Fransị. Ọ gụ kwara akwụkwọ na General Staff College nke dị na Koulikoro, Mali. Dembele nwekwara asambodo nke mahadum dị na Paris ebe ọ gụrụ maka ihe mere nke bụ History na bekee. Ọ bụbu onyeisi na-ahụ maka esemokwu na nhazị nke otu African Union peace and security Commision dị n'Addis Ababa na mba Ethiopia. O nwere asambodo mmụta Masters sitere na mahadum Federal Army University dị na Munich, Jamanị. 3) Col Sadio Camara Col Camara bụbu onyeisi Kati Military Academy. A mụrụ ya n'afọ 1979 n'obodo Kita. Camara bụ onye nchịkọta Kita Military academy ma mechaa gaa mba Rụshịa maka ọmụmụ agha. Gịnị mere na Mali? O teela ndị mmadụ ji malite ime ngagharịiwe ka Boubakar Keita rituo n'ọkwa mana ọ jụwara isi. Ndị na-akatọ ya kwuru na nrụrụaka gọọmentị emeela ka ọnọdụ akụnụba mba Mali tikpọọ. Ọzọkwa bụ na ndị agha ụka alakụba nke Bekee kpọrọ 'Jihadists' emeela ọtụtụ mmadụ na mba Mali ụra aga n'anya. Ibrahim Keita Mana n'ụtụtụ ka a nụrụ ka egbe na-ada aghara aghara n'ogige ndị agha, nke mere ka akụkọ malite ifegharị na ndị agha na-achọ ichutu onyeisiala n'ike. Na mgbede ya, ọnụ na-ekwuru gọọmentị mba Mali bụ Yaya Sangare gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndịagha anwụchiela onyeisiala Keita nakwa Praịm Mịnịsta Cisse. Ngwangwa ahụ ka otu Ecowas ji zipu ozi ma katọọ ya bụ ihe. Mba Denmark nakwa Fransị sochiri ha azụ. Boubakar Keita na onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron N'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde, Onyeisiala Ibrahim Keita pụtara n'onyonyo TV kwuo na ya agbaala arụkwaghịm. O kwukwara na ya ekposaala ụlọomeiwu mba ahụ. Keïta kwuru sị: ""Achọghị m ka a kwafuo ọbara ọbụla makana a chọrọ idowe m n'ọchịchị."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: Ọrụ ugbo m na-arụ si m n'obi pụta" afirika-57252268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57252268,"Ọgbambọ: ""A na m e ji abalị abụọ arụpụta welding machine n'Aba'- Chinedu Ogboms","Otu nwamadị bụ Chinedu e ji Ogboms maara kọwaara etu o si malite ịrụ ihe e ji agbakọta ọkụ bụ 'wielding machine' n'Aba, Abia Steetị.",Ọ sị na ọ bụ n'aka nna ya ka ya na ụmụnne ya mụtara etu e si arụ igwe a. Chinedu gara n'ihu kọwaa ihe mere ndị na-agba igwe ọkụ ji azụ nke ha na-arụ karịa nke si obodo oyibo. O tinyekwara ọnụ n'ihe mere e ji asị na 'Aba bụ Japan' nke Afrịka. Kirie ihe o kwuru n'uju: Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo mba-uba-43081945,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43081945,"Na Zamfara steeti, ọgụ erịala isi mmadụ 35",Mana ndị uwe ojii na Zamfara steeti na-ekwu na ndị bu egbe gbagburu mmadụ iri na asatọ n' obodo ahụ ụnyaahụ mgbe ndị nta na ndị na-ọchị ehi bidoro ọgụ n'ime ohia.,"N'ozi mgbasa ozi nke Gọvanọ Abubakar wepụtara, ọ katọrọ mkpamkpa nke ndị omekome, ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha mee gbanụgbanụ nwụchie ndị mere mpụ ahụ. O kwuru na nsogbu nchekwa na-emetụta akụnaụba nke ga-akwalite steeti ahụ, n'ihi na e nweghị udo, oganihu agaghị adị. Ọ gara n'ihu tie ndị ezinaụlọ ndị e gburu na ndị merụrụ ahụ aka n'obi, ma rịọ Allah ka o nye ndị nwuru anwụ udo." afirika-50802088,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50802088,Josephine Ugwu: Nwaanyị ritere ụlọ site n'iweghachi ego ruru $12m,"Nwaada Josephine Ugwu ritere onyinyo ụlọ n'aka gọọmentị maka iweghachi ego ruru nde dọla iri na abụọ($12,000,000).","Ọ hụrụ ego ndị a mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka onye na-ehicha ụlọ n'ọdọụgbọala dị na Legọs. Ọ gwara BBC Igbo n'agbanyeghị na o nweghi ego na ọ bụ ịtụ egwu Chineke mere o ji weghachiri onye nwe ya ego ahụ. Josephine sị na ọtụtụ mmadụ hụtara ya dịka 'onye iberibe' mana ugbua ọ bụrụla onye nwe ụlọ nke ya. Ọ gara n'ihu nye ndụmọdụ ka ndị mmadụ nwee ndidi ma hapụ ịgbaso agwa 'a baa taa, a nwụọ echi'. Gere ihe o kwuru n'uju n'ime ihe onyonyo a:" 42775970,https://www.bbc.com/igbo/42775970,Ronaldo ji ugegbe lee ịhe mere ya n'ihu,Onye egwuregwu bọọlụ Cristiano Ronaldo abaala akụkọ makana o ji ose foto dị n'ime ekwentị dibia bekee otu ha lee anya n'ihu ya.,"Ronaldo ji ekwe ntị me enyo Ronaldo mmerụ ahụ n'ihu maka Fabian Schar onye otu Deportivo kụru ya ukwu n'isi. Ndị na-akọwa egwuregwu bọọlụ a na-akpọ 'commentators' na asụsụ bekee chịrị Ronaldo ọchị. Ha kwuru na ahụbeghị udi ihe anke a ọ mere. Ndị nta akụkọ Reuters dere na Ronaldo ebuliteela mma ihu ya rụ ọkwa diiche. N'elu social media, ọtụtụ mmadụ na-achị Ronaldo ọchị n'ihi na-ole onwe ya na ugegbe. Agbanyeghi na a na achi ya ọcchi, ndị ma maka ya sị na ịhe mere Ronaldo adịghi nfe. End of Twitter post, 1 Real Madrid gbaa Depotivo ọkpụ asaa asatara otu." afirika-43407834,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43407834,Ụlọikpe adọọla ndị omeiwu aka na ntị,Ụlọịkpe nke Abuja agwaala ndị omeiwu ala Naijirịa ka ha wepu aka na ihe gbasara iwu ọhụrụ nke ntụlịaka afọ nke a.,Ipke nke a bụ maka usoro a ga-eji mee ntụliaka nke afọ 2019. Okaiwu Ahmed Mohammed gwara ọnyeọbụla okwu nke a metụtara ka ha chere oge ụlọịkpe ga-ege ikpe nke a n'oge ọzọ. Mohammed ji iwu ala dị iche iche were kwadọ nkpebi nke a. Ụlọịkpe a ga-ege ikpe a ọzọ n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa a. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 50570268,https://www.bbc.com/igbo/50570268,Imo Budget: Ihedioha eweputala Bojet 2020 nke steeti Imo,"Gọvanọ na-achị steeti Imo bụ Emeka Ihedioha nọoro ta n'ulo omeiwu steeti ahụ ma gbaa n'anwu, bụ atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2020.Atụmatụ a, bụ nke ọ kpọrọ 'atụmatụ Bojet nke ịrụzigharị steeti Imo nke mbụ' bụ nke pụtara ijeri naira 197,607,272,328.","Lee etu e si gbari ya bu ego ebe a: - Ego a ga-emefu n'ọrụ ọhụrụ - ijeri naịra 106,229,450,200 - Ego a ga-emefu n'ọrụ ochie - ijeri naịra 91,377,822,128 - Ego a ga-emefeu n'ọrụ - ijeri naịra 41,381,250,95. Ihedioha kọwara na isi sekpụ ntị na bọjetị a bụ ịwụgharị Imo steeti ka ọ dịrị etu ọ dị na mbụ. Ndị ntọ atọrọla Fada ọzọ n'Enugwu Fada Malachy Asadu abụrụla fada ọzọ ndị ntọ tọrọ n'Enugwu kemgbe afọ 2019. Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC Igbo n'ekwentị na atọrọ Asadu na mpaghara Nsukka. O kwuru na ndị uweojii jisike eme nyocha ka ha chọpụta Fada ahụ atọrọ kemgbe ụbọchị Monde. A tọrọla ihe karịrị Fada Katọlik iri n'Enugwu kemgbe afọ a, agbapụtala ụfọdụ ebe ụfọdụ nwụrụ n'aka ndị ji ha. Gọmenti Ebonyi sị na ndị nwereonwe Biafra anọghị ebe ahụ Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ọnweghị otu nwereonwe Biafra nọ na steeti ahụ. Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa na okeala bụ Stanley Emegha gwarakwara ndị nta akụkọ nke a mgbe ọ gọrọ na ọnweghị otu Bakasi Boys nọ ebe ahụ ịlụsa otu nwereonwe Bịafra ọbụla ọgụ na Steeti ahụ. Emegha sị na onweghị ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) maọbụ ndị otu ọzọ na-alụọgụ nwereonwe Biafra nọ na ya bụ steeti ma ọlị. Okwukere na-onweghị ndị otu ehibere dịka Bakasi Boys maka ịmeru otu otu ndị nwereonwe. O wuru na soshal media na otu na e hibere otu Bakassi Boys ka ewere buso otu nwereonwe Biafra aha maka mgbagha ha na-agbagha atụmatụ RUGA n'ọwụwaanyanwụ. Mana gọọmenti Ebonyi steeti sị na nke a bụ ọkpụrụkpụ asị. Kọmishọna nchekwa na okeala kwuru na ""ndị mmdụ nwere ike ị nọ n'ụlọ ha na-ekwu na ha bụ nke a maọbụ nke ọzọ, mana gọọmenti Ebonyi steeti amaghị ndị ha bụ, n'ezie"". Obiano na ọdọugboelu Anambra steeti Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Ndị Anambra ṅụrịa na ihe ọnụ emeela. Gọvanọ Willie Obiano ekwuola na ya ga-arụcha ọdọụgbọelụ Steeti ahụ n'ọnwa iri na asatọ. Obiano kwere nkwa a ka ha na ndị ji ego achụ ego na-ezuko n'Amawbia, ụnyaahụ. EFFC na Diezani Alison Madueke Diezani ka na-agọ ebubo dị ya n'isi Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC akatọọla akụkọ kwuru na ha esepula aka n'ebubo mpụ ha boro onye bụbu minista mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison Madueke. Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ a bụ Wilson Uwujaren kwuru na akụkọ ahụ bụ asị gbara ọkpụrụkpụ. A ga-egbu isi ndị mgbuisi an Bangladesh A maala mmadụ asaa ndị ọlụọ ọla ụkọ Alakụba ikpe ọnwụ maka mkpamkpa ha kpara na Bangladesh2016. Mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ maka ogbunigwe ha gbara n'ụlọnkwari na Dhaka. Kedu olile anya Rohr Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Nchịkọta egwuregwu ndị Nịajirịa bụ Gernot Rohr sị na ọ bụ n'ọnwa Januwaị 2020 ka ya na onyeisi NFF ga-anọkọ kpaa maka ọdịnihu ya na Super Eagles. Cheta na Rohr nọgoro afọ atọ n'ọrụ ya sị na obi juru ya afọ na ngbawe owetere na n'otu ahụ. Nga mkpụrụọka na-eche ndị nrụrụaka ndọrọndọrọ Onye a tụrụ ịga Ndị ntọ na ndị nrụrụaka ndọrọndọrọ ọchịchị kee nkwụcha maka akamgba ndị gọọmenti. Ndị ụlọomeiwu ukwu amalitela ịme ka ewelie afọ ole ndị omekaome a ga-anọ na mkpọrọ. Anyị nụrụ na ndị ntọ ga na-agazị nga mkpụrụọka ma ya bụ iwu malite ị dị ire karịa afọ iri ka ọ dị ugbua. N'otu aka ahụ ka ndị omeiwu ahụ ji chọkwa ịkpatụ iwu gbasara ịwakpọ nwaanyị nke ndị na agba nke 357 n'akwụkwọ iwu Naịjiria. Onye kwulitere nke a bụ Oluremi Tinubu bụ onye chọrọ ka e tinye ụmụnwoke ma e kwuwe okwu nwakpo n'ihi na ọ bụghị naani nwaanyị ka a na-awakpo. Trump nwere ike ịbịa zara ọnụ ya Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ofesi, Onyeisiala Trump nwere ohere ị bịa zara ọnụ ya, maọbụ kwụsị mkpesa maka nyocha a na-eme ya. Ọ bụ onyeisi kọmiti na-eme ya bụ nyocha bụ Jerrold Nadler sị na ya nyere Trump ụbọchị anọ nke ọnwa Disemba ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo a na-ebo ya maka ịkwanye ndị Ukrain ka ha nyocha Hunter Biden. Lewandowski akụwala efere nrite na Champions League N'egwuregwu, Robert Lewandowski abụrụla onye kacha nye goolu ngwa ngwa na Champions League. Ọ eziokwu. Ya bụ nwaadị na-agbara Bayern Munich nyere goolu anọ na nkeji iri na anọ n'ime goolu isii ha ji merie Red Star Belgrede na asọmpi ha ụnyahu. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Chukwuemeka Ezeife sị na ihe kara ndị Igbo mma kitaa bụ 'restructuring'." afirika-45745413,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45745413,Akụkọ dị mkpa taa: Mmadụ 21 anwụọla na Platu steeti,Akụkọ kachasị dị mkpa taa:,"Okwu anyị nụrụ ugbua bụ na ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'otu anwụọla na Plateau steeti mgbe ndị bu egbe wakporo ha na. Onyeisioche okpuruọchịchị Barkin Ladi bụ Dickson Chollom gwara BBC na ndị ahụ ji egbe malitere ị gba ndị mmadụ egbe n'abali wenzde. Okwu ntukliaka imeụlọ APC ka na-ewu kwa Ndị ga-ebinye aka eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a n'Enugwu Ihe pụtara ugbua bụ na kọmiti na-ahụ maka pati APC akagbuola nke emere n'Edo steeti ebe otu ụlọịkpe n'enugwu jụrụ itinye iwu ga-eme ka akwụsị ntụlịaka imeụlọ APC maka ọkwa gọvanọ n'Enugwu Na mba ofesi, Otu onye bubu onyeisi otu ndị na-eyi ndụ egwu na Somalia bụ Al Shabab apụtala ịzọ ọkwa ọchịchị n'obodo ahụ. Mukhtar Robow ga-azọ ọkwa onyeisiala mpaghara ọdịda anyanwụ n'obodo ahụ. N'egwuregwu, Cristiano Ronaldo asaala ebubo mwakpo otu nwata nwaanyị boro ya. Onye ogba bọọlụ a amama depụtara n'akara Twitter ya kwuo na mwakpo nwaanyị bụ ihe megidere ihe niile o kwenyere na ya"" Gee nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ihe Ndigbo chọrọ N'ụtụtụ, Enyimba akpụọla afọ n'ala na CAF Enyimba International FC Aba ebuola iko champions league Afrika ugboro abụ ma bukwasakwa ya iko nke Federation kemgbe 2001 Ụmụnna a ọ dịzịka ka Enyimba ana awụzị ka nwa atụrụ na Confederation Cup na-abịanụ. Raja Casablanca nke Moroco ji otu kpondo seghachie Enyimba aka elekere azụ n'asompi ha gbara n'Aba,ụnyahụ. Gọmenti etiti sị na ha agaghị etinye ego n'ụkwọ akwụkwọ Mahadum Legós Gọmentị etiti ekwuọla na ọnweghị mgbe ha bụ n'obi iweli ụgbọ akwụkwọ ndị mahadụm. Odeakwụkwọ ukwu nke ministry na ahụ maka akwụkwọ bụ Sonny Echono kwuputara nke a ụnyaahụ bụ Wenezde n' Abuja. PDP Enyela Sam Egwu na Chimaraoke ọkọrọtọ PDP chiburu Naịjirịa afo iri na isii Chimaraoke Nnamani na Sam Egwu bụ ndị chịburu dịka gọvanọ Enugwu nakwa Ebonyi steeti enwetala ikike ndị PDP ịnọchite mpaghara ha n'ụlọomeiwu ukwu Naijiria. N'otu aka ahụkwa ka aka chịburu Abia bụ Theodore Orji, Enyinnaya Abaribe, nakwa Mao Ohuabunwa sị nwetakwa ikike pati ahụ na-ịnọchite Abia-Central, Abia South, nakwa Abia- North na ntulika 2019. Mmadụ 259 anwụọla maka selfie n'ụwa Nwoke nọ na ugwu na-agbọpụta ọkụ bekee kpọrọ volcano Ndị ọkammụta achọpụtala na ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na itoolu (259) anwụọla ebe ha na-ese onwe ha foto nke bekee kpọrọ selfie site n'afọ 2011 ruo 2017. Nke a dị n' akwụkwọ nchọpụta a kpọrọ 'Journal of Family Medicine and Primary Care nke Mahadụm ahụike biputata n' Indịa. Gee nkeji anyị nke tata Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị: Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha" media-52100235,https://www.bbc.com/igbo/media-52100235,Covid 19 n'otu nkeji: Ite okwuma o nwerike igbochi coronavirus,Okwuma nwere ọtụtụ ihe ọ na-egbochi nke ejiri mara ya.,"Mana ụfọdụ mmadụ ekwupụtala na e ji okwuma agwọ coronavirus ma a na-ete ya aka. Kirie ihe onyoonyo a ka ị mara ma ọ bụ eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Chimamaka Ihenacho na Chimezie Ucheagbo" afirika-48486893,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48486893,Gunmen attack at Okorocha's: Ndị uweojii na-enyocha ndị gara njem ọjọọ be Okorocha,"Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo ekwuola na ya agaghị ekwu ihe ọbụla gbasara nwakpo ndị eche na ha bụ ndị okpu ara ọbara wakporo be Rochas Okorocha na Ogboko, Ideato South nke Imo State.","Rochas Okorocha nọ n'agba nke abụọ dịka Gọvanọ Imo steeti Ọ sị na ha ""ga-eziputara ndị nta akụkọ akwụkwọ ka ya bụ nwakpo sịrị gaa ụbọchị ụka iji kọwara ọha na eze ka ya bụ arụ siri mee. Cheta na Okorocha nwụsara ọwara dịka gọvanọ Imo steeti na 29 nke ọnwa Mee. Kemgbe ahụ emebiela Akachi Tower n""owerri nke amabeghị ndị mere ya ruo ụgbụa. N'ụtụtụ a ka akụkọ pụtara na ndị o ji egbe ezu wakporo be Okorocha n'ime abali Fraịde ma onweghị ihe ha weere maọbụ onye emeruru ahụ. Nke mere ka ndị mmadụ chewa na ọ bụ ndị ogbu ara ọbara bịara njem ahụ. Onwebeghị onye ma ihe mere ebe ahụ ruo ugbua. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44458541,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44458541,Ndị uweojii na-achọ ndị 'gburu' igwe ndị Akpugo Nkanu n'Enugwu,"Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu, ekwuola na ndị uweojii amalitela nyocha ịmata ihe kpatara nsogbu dịbu n'etiti Igwe ndị Ọgbọzinne, Akpugo, bụ Steven Nwatu na ndị obodo ọ na-achị nke tara isi ya bụ onye eze.","Nchọpụta gosiri na esemokwu ahụ bịdoro kamgbe afọ iri, Steven Nwatu were oche dịka onyeeze. Ndị obodo kwuru na okweghị ka ahọpụta ndị otu na-achị obodo a na-akpọ 'Town Union'. Nke a mere ndị obodo jịrị gaa oge na adịghị anya mee ngagharị iwe n'ụlọ gọọmentị Enugwu ma kpọpụ eze ahụ n'ụlọ ikpe. Ndị hụrụ mgbe ya bụ ọdachị mere kwuru na ndị otu igwe na ndị ọzọ na-alụ ọgụ, oge agbara igwe ahụ ọtọ ma kụọ ya ihe nnukwu. E buru ya gbaga n'ụlọọgwụ Parklane Enugwu, ebe ọ nọ wee nwụọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44601113,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44601113,Ikpe Nnamdi kanu: Abaribe ọ ga-anọ n'ọchị ka ọbụ akwa taa?,"Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018, ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ.","Mana Ọkaikpe Nyako nọkwa n'ụlọikpe n'Abuja ụnyaahụ kwụgharịkwa na ha agwala ndị niile gbaara Nnamdi Kanu akaebe ka ha niile bịa ụlọikpe taa maọbụ kwuo ihe mere ha agaghị eji gaa nga ma hapụ ego ha jiri gbaa akaebe. Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi. Ndị gbara aka ebe ahụ bụ Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite anya ndịda Abịa n'ụlọ omeiwu sineti, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ Immanuel El-shalom na otu onye ọzọ bi n'Abuja bụ Tochukwu Uchendu. Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegide ọchịchị ala Naijiria, bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Sepụtemba afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ya oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa. Nyako ga-ekpe ikpe ahụ taa n'Abuja ebe a ga-anọ mara ihe ga-eme Abaribe na ndị ọzọ so ya gbaa akaebe ahụ. Cheta na Abaribe na ndị ọzọ ahụ gbara akaebe ahụ ụbọchị 28 ọnwa Epurel afọ 2017, ma kwe nkwa ịkpọta Kanu n'ụlọikpe maka ikpe ya dịka ha debere ego ruru otu narị nde naịra. Ndị ọrụ nchekwa DSS nwụchiri Abaribe kamgbe ngwụcha izuụka mana ha ekwughi ihe o mere ha jiri nwụchie ya. Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-46895952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46895952,Basket Making: Etu e si akpa nkata,Nkata bụ ihe Igbo ji egbo mkpa dị iche iche.,"Ha ji ya ebu ihe ewetara n'ubi dịka ji,ede, tomato na ihe ndị ọzọ. Ha jịkwa ya ekpofu ahịhịa. Na mkparitaụka ya na BBC Igbo,ọkpa nkata bụ Josephat Mmadu,onye Olo n'Eziagu,Enugwu steeti, kọwara etu e si eji ihe e wetara na nkwụ were akpa nkata. O kwukwara na nd nwaanyị anaghị akpa nkata n'obodo ha. Lee ya n'uju n'ihe nkiri a: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52345628,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52345628,Canada shooting: Egbuola nwoke gbagburu mmadụ 16 na Kanada,Ndị uweojii ekwuola na otu nwoke aha ya bụ Gabriel Worthman gbara afo iri ise na otu ji egbe gbagbuo mmadu iri na isii nke gụnyere otu onye uweojii n'obodo Nova scotia nke dị na mba kanada n'ụbọchị satụde alaala mụọ dịka ndị uweojii na achọ ijide ya.,"Images on social media showed burnt cars on a highway where the suspect was chased Otu onyeisi ndị uweojii bụ Chris Leather gwara ndị ntaakụkọ na ha chọtara nwoke a n'ụbọchi sunde n'ebe gwongworo ya a nọ. Leather kwuru na ha amatabeghị ebum n'ụche nwoke a ma kọwaa na Worthman yi ụfọdụ uwe ndi uweojii ma nyara kwa ugbọala nke dka nke ndị ụweojii nke mere ka ijide ya sie ike. Ọ kọwara na mkpamkpa bụ nkata agbara nke ọma ebe nwoke a ji ụgbọala ndị uwe ojii na uwe ha were gbuo ọchụ a. Leather kwukwara na ha gwara ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ ma meche ụzọ ha mgbe ha na-achọ Worthman. Onyeisi otu ndị uweojii bụ Brian Suave kwuputara obi iri-uju ha ọkachasị onyeuweojii bụ Constble Heidi Stevenson onye nwụrụ n'aka nwoke a ma too ndị uweojii niile tinyere aka n'ijide nwoke a ọkachasị ndị merụrụ ahụ. Onye ọchịchị obodo Nova Scotia kwuru na obodo a ahutubeghị ụdịrị mkpamkpa mbụ ma sị "" amaghị m na ọ bụ ụdịrị akụko a ka m ga-eji teta ụra n'ụbọchi taa, na otu onye omekome na-agba egbe aghara aghara"". N'otu aka ahụ ka onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau kwuru na akara twitter ya "" Obi anyị nọnyere ndi niile mkpamkpa a metụtara, anyị so unu eri uju""." afirika-47482477,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47482477,"Imo State Elections 2019: ""Rochas rụrụ ọrụ karịa gọvanọ ndị ọzọ"" - Ndị Imo",Ndị Imo gwara BBC Igbo ihe ha ga-eji echeta ọchịchị Rochas Okorocha.,Okorocha bụ aka chịrị Imo steeti agba abụọ site n'afọ 2011 rue afọ 2019 ebe ọ ga-aritu n'ọkwa. Cheta na Rochas Okorocha na ndị otu pati ya bụ APC maka okwu dị icheiche. afirika-45491103,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45491103,IPOB: Ndị uweojii enweghi ikike ịmachi iwu Ipob,"N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ ọkaiwu Obele Chuka bụbu onyeisi otu ndị ọkaiwu akpọrọ NBA n'ịchafụ nke Nnewi, ma iwu ọ machiri ị nọ n'ụlọ ndị Ipob sịrị ka ndị mmadụ mee.","O kwuru na onweghi iwu machiri ndị mmadụ i gosipụta iwe ha site n'ịnọ n'ụlọ. N'ihi na ihe a na-eme ndị Igbo adịghị mma. Chuka kwuru na ụlọikpe Naịjirịa ekwuola na ndị uweojii enweghi ikike ọbụla inye ndị mmadụ akwụkwọ eji eme ngagharị iwe. N'otu aka ahụ, ọtu dị iri na abụọ gbakọtara n'Enugwu ma kwadoo iwu ị nọ n'ụlọ ndị Ipob hiwere n'abalị iri na anọ nke ọnwa Seputemba, afọ 2018. Onye kpokọtara otu ndị ahụ bụ osote onyeisi Ndị Eastern Consultative Assembly bụ Maria Okwor. Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra Okwor kwuru na ihe mere ha ji akwado ị nọ n'ụlọ bụ maka mmekpa ahụ e mere ụmụnwaanyị n'Owere. Ndị bịara n'ọgbakọ ahụ gụnyere ndị Eze, ndị isi ọdịnala, ndị na-azụ ahịa nakwa ụmụakwụkwọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44117740,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44117740,Ọ bụghị ogbunigwe gbara n'Enugwu- Ndị uweojii,Onye na-ekwuchitere ndị uweoji ọnụ ha n'Enugwu steeti bụ DSP Ebere Amaraizu ekwuola na ihe ahụ gbawara n'ụlọ ụka Holy cross Iji Nike ụbọchị Monde abụghị ogbunigwe.,"Ogbunigwe na-adakari Naịjirịa mere ka ndị nọ n'ụlọ ụka tụọ ezigbo ụjọ maka ndụ ha O kwuru na ọ bụ ọkụ oyibo eji eme mmemme(fireworks). Amarizu kowara na ozigbo ihe ahụ mere na ndị uweoji ogbunigwe di na aka were ọsọsọ gaa na ya bụ ulọụka ịga chọpụta ihe merenụ Mana oge ha rutere ebe ahụ ha chọpụtara na ya bụ ihe akpaghị ike dika O kwukwara na ọ kwatugikwa ụlọụka ma ọli. Mgbe BBC batara na ya bụ ụlọụka anyị hụrụ na eji nnukwu igodo gbachie ụlọụka ahụ nke mere na anyị abaghị n'ime ya. E chere na ogbunigwe a gbara n'ụlọụka katolik si n'oge Agha Biafra Onye isi nchụ aja na ya bụ Holy Cross Catholic Church, Iji Nike, Enugwu steeti, bu Reverend Father Emmanuel Okwor anọghị oge anyị rutere nụlọ ụka ahụ. Ndi mmadu jukwara na ya bụ ụlọụka na-ekpe ekpere. Cheta na ya bu ihe gbara unyahụ oge ndi mmadụ na-abia uka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44917606,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44917606,Mesut Özil: Agaghị m agbara Jamini bọọlụ ọzọ,Mesut Özil bụ aha a ma ama n'egwuregtwu bọọlụ na mbaụwa eziela ozi kwuo na ọ gaghị agbara mba Jamini bọọlụ ọzọ maka ịkpa oke agbụrụ na mkparị ndị ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-enya ya na Jamini.,"O depụtara ozi a n'elu akara soshal midia nke Twitter ya na o teela aka ndị ntaaakụkọ na-akparị ya maka na ọ bụ onye si mba ọzọ bụ Tọki n'abụghị Jamini. End of Twitter post, 1 O kwuru na ndị ntaakụkọ ahụ gbadoro aka na ọ bụ onye Tọki jiri na-ata ya ụta maka na a gbapụrụm Jamini n'Iko mbaụwa nke 2018. Ọ sị ""ọ bụ obi tiwara etiwa na oke nwute ka m ji kpebie ịkwụsị ịgbara otu egwuregwu mba Jamini bọọlụ"" ""Ọ bụ maka na DFB kparịrị m, kparịa agbụrụ m nakwa jiri m mee ihe ndọrọndọrọ ka m ji kwuo nke a. Ya bụ ihe ejula m afọ."" Cheta na Özil bụ onye Jamini na kwa Tọkị na-agbara otu egwuregwu Arsenal nke mba Briten bọọlụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45495084,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45495084,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: George Weah emeela ihe o jiri bụrụ dike,"Akụkọ ndị dị mkpa: N'egwuregwu,","Onyeisiala mba Liberia George Weah gbara ala ya bọọlụ ụnyaahụ mgbe ha na Naịjirịa sọkọtara mpi enyi na enyi na Monrovia. Nke a mere iji kwanyere uwe nke akara ya bụ iri na anọ ugwu ikpeazu dịka ya bụ uwe ga-ala ezumike nka na Liberia. Ọzọ, End of Twitter post, 1 Aka na-achị Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi amanyela kọmitii ga-ahụ maka nwulite ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. O kwuru na ọ dị mkpa ka ọdịda anyawu nwee ọdọụgbọelụ nke mba ofesi nakwa na ọ ga-ahụ na e mezuru ya. Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghị ihe gosiri ọrụ gọọmentị steetị ha maọbụ nke gọọmenti etiti Gọọmentị etiti enyela steeti dị icheiche iwu ha ga-emezu maọbụrụ na ha chọrọ iketa oke n'ime ego akpọrọ Paris Club refund. Ihe ndị a gụnyere ịkwụ ndịọrụ ụgwọ ọnwa nakwa ị kwụghachị ego niile ha bitere n'aka gọọmentị etiti Na mba ofesi, Naanị otu ọdọ ụgboelu na-arụ ọrụ na mba Tripoli agbachiela n'abali Tuusde mgbe a tụrụ ya ogbunigwe. Rue ugbua amabeghị ma o nwere onye nwụrụ maọbụ ihe mere mmebi na ya bụ ọdọ ụgbọelu. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: 'Not to young to run' abụghị maka ogbenye ọnụ ntụ - APC" afirika-44689981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44689981,"Phyno: Ihe ise eji aba mmọnwụ ""rap""",Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise o mere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee.,"BBC gbara Chibuzo Azubuike aha otutu ya bụ 'Phyno' ajụjụọnụ ebe ọ nọ gbaara anyị ama ka ya bụ oke enwe sị taa akwụ n'ọhịa were bụrụ ọkaibe n'egwu mbem bekee a kpọrọ ""rap"". Akụkọ ga-amasị gị:" 44319387,https://www.bbc.com/igbo/44319387,"Nwa afọ, Chiwetel Ejiofor ga-eso n'ihe nkiri 'Maleficent 2'","Nwa afọ Igbo bụ Chiwetel Ejiofor na onye ihe nkiri a ma ama bụ Angelina Jolie ga-eso na agba nke abụọ ihe nkiri, ""Maleficent"" nke ụlọọrụ Walt Disney na-ewepụta.","A mara Chiwetel maka isonye n'ihe nkiri '12 Years a Slave"". Dịka ụlọọrụ Disney siri kọwaa, e bidola mmepụta ihe nkiri ahụ nke onye nhazi mmepụta ya bụ Joachim Rønning. Ihe nkiri a ritere ego kariri nde dọla 750 ($750m) oge e meburu ya na mbụ. Ndị ọzọ kara aka ga-eso n'ihe nkiri ahụ bụ Michelle Pfeiffer, Harris Dickinson na Robert Lindsay so n'ihe nkiri ahụ Walt Disney mepụtara mbụ n'afọ 2014. Chiwetel Ejiofor, a mụrụ na mba Briten wara ka ọnwa afọ ole na ole gara aga oge ọ pụtara n'ihe nkiri a kpọrọ,""12 Years a Slave"". Ejiofor eritela ọtụtụ nturugo n'ime ihe nkiri gụnyere 'Laurence Olivier' n'afọ 2008, 'BAFTA Orange Rising Star' n'afọ 2006 nakwa mkpọpụta aha ugboro abụọ maka nturugo 'Golden Globe.' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43557829,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43557829,Akụkọ kachasi taa: Iwe ji onye nchịkọta Super Eagles,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Aka na-achi Enugu steeti, Ifeanyi Ugwuanyi akwadola ka a kwụọ ndị ọrụ ruru ọnụọgụgụ narị asaa na iri atọ na otu ụgwọ ọnwa. Ndị ọrụ a bụ ndị esi n'ụlọọrụ parastatal; ndị ọzọ na steeti ahụ webata dịka ndị ọrụ steeti ahụ. Dino Melaye na ndị uweojii na-akwata ya Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka e wepu kọmishọna ndị uweojii na Kogi steeti bụ Ali Janga. Nke a bụ maka mmadụ isii ndị boro Dino Melaye ebubo gbanahụrị ndị uwe ojii. Melaye enyekwala ndị uwe uweojii mkpụrụ ụbọchị abụọ ịchọta ha. Na mba ofesi Malala Yousafzai alaghachila obodo ya bụ Pakistan nke mbụ kemgbe ndị agha Taliban gbasịrị ya egbe. Cheta na Yousafzai natara mgbo n'isi n'afọ 2012 maka na ọ na-ekwupụ okwu ka ụmụnwaanyị gụwa akwụkwọ. N'egwuregwu Obi adịghị onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr mma ebe Alex Iwobi nọ. Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi Nke a bụ maka mmeri Serbia meriri Naịjirịa na asọmpi enyi na enyi mba abụọ ahụ gbara. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ule ụlọ mkpọrọ Kedu ndị kachasị esi ofe nke oma? Ofe nsala bụ ofe na-amasị ndị Igbo nke ukwuu. A na-eji ma azụ ndụ ma anụ ọkụkọ maọbụ anụ ewu esi ya." media-45759227,https://www.bbc.com/igbo/media-45759227,Muna na-eto n'Amerịka mana ọ na-asụ Igbo karịa ụfọdụ ndị nọ n'ala Igbo,"Ebe ụfọdụ na-agbaga mba ofesi iji gbalarị ịsụ asụsụ Igbo, Obyno Daddy-Muna na nwunye ya bụ Sweet Diva Olivia na-akụziri nwa ha Igbo ebe ha bi n'Amerịka.","Nwa ya nwaanyị bụ Muna na-egosi mmasị dị egwu gbasara asụsụ na omenaala Igbo dịka nna ya si egosi ya. Otu ihe ịtụ n'anya gbasara Muna bụ na agbanyeghi na a mụrụ ya n'ala Bekee, ọ naghị asụ Igbo dịka onye ofesi, ọ na-asụ ya dịka onye Igbo toro n'ala Igbo. Obyno na Sweet Diva na-enwe ọṅụ ikuziri nwa ha Igbo maka na ọ na-eme ha niile a na-enwe ezi mmekọ dịka nna, nne na nwa. O kwuru na ya na nwunye ya na-agba mbọ hụ na ndị ha na-akpọta ileta nwa ha n'Amerịka ga na-enyekwa aka kwadoo ya bụ asụsụ Igbo ha na-akụziri nwa ha. Obyno ekwuola na onye ọbụla na-akụzighịrị nwa ya Igbo bụ ya ka ụta dịrị na ngwụcha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44727708,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44727708,Anyị enweghi nkewa ọbụla - APC,"Agbanyeghi na ụfọdụ ndị mmadụ nọ na pati APC pụtara ụnyaahụ kpọọ onwe ha 'Reformed APC', pati APC apụtala kwuo na ha enweghi nkewa ọbụla.","APC enweela nsogbo ntụlịaka imeụlọ n'ime steeti di iche iche Akwụkwọ onye na-ahụ maka mgbasa ozi na pati ahụ bụ Mallam Bolaji Abdullahi kwuru na ọ bụ ndị chọrọ ikposa ntụlịaka imeụlọ otu ha bụ ndị mụpụtara otu ahụ. O kwukwara na ndị na-enye ndị na-achị otu a ga-eduba ha n'ime ọhịa. Abdullahi kwukwara na ha na-nyocha ma ndị a ha bụ ndị otu APC n'ezie nakwa na ha na-ele kwa otu ọhụrụ a anya ike, tupu ha mara ma ha ga-ekpe ha n'ụlọikpe. Abdullahi kwusiri ike na APC n'arịọ kwa ndị na-eweso APC nnukwu iwe na ndị na-achị otu a ọhụrụ ga-eleba anya n'iwe ha n'oge eteela aka. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48159587,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48159587,Abuja Police raid: 'A ga-ata ndị uweojii na-anwụchi ụmụnwaanyị ahụhụ',Ndị uweojii asaala oku ngagharịiwe emere n'Abuja,"Akụkọ kachasị taa Ndị uweojii asaala okwu banyere ngagharịiwe emere n'Abuja n'ụbọchị Satọde maka etu ndị orụ ha ji anwụchịkọ ụmụnwaanyị ndị na-eyi uwe ga-egosi anụahụ ha. Usman Umar bụ kọmshịọna ndị uweojii n'Abuja kwuru na ha ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa n'Abuja ga-anọ kpaa nkata maka ihe mere eji amwụchi ụmụnwaanyị ndị a Nwannyí amara ikpe maka mgbere agbọghọ O kwuru ""Anyị amalitela nyocha banyere nke a, anyị ga-ata ndị aka ha dị na ya ahụhụ ruru ha. Ndị naa-ahụ maka ikike ruru onye pụtara n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja malite ngagharịiwe n'ihi etu ndị uweojii si anwụchịkọ ụmụnwaanyị ndị na-eyi uwe ga-egosi anụahụ ha. Ha yi uwe dị ojii si na 'Old Parade' dị n'Abuja rue n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja. N'aka nke ọzọ ndị nchekwa DSS kwuru na ha nwụchie ndị na-eji ahụ ha achọ ego di iri ise na itoolu na Calabar Onyeisi DSS na Calabar bụ Ilupeju Adebayo kwuru na ndị a anwụchiri n'isi ụtụtụ Satọde karịrị n'ụmụnwaanyị. Jamb akọwala ihe ji mpụtara ule nke afọ Ụlọọrụ Jamb ekwuola na ihe mere ha jiri egbu oge n'iwepụta mpụtara ule nke afọ a bụ n'ihi nyocha tara ọchịchị ha na-eme banyere mpụtara ule a. Ọnụ na-ekwuru Jamb bụ Fabian Benjamin kwuru nke a n'iji zaa ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-eju banyere ule ahụ. N'ofesi Mba Isreal na ndị na-eyi ndụ egwu na mba Palestine kwarịtara onwe ha mgbọ nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-agba ọsọ izendụ Otu onye Palentine nwụrụ ebe ndị Isreal abụọ merụrụ ahụ n'ihi nke a. N'egwuregwu Otu ndị na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ gụnyere FIFA na NFF akwanyerela onye na-agbara Naịjirịa bọọlụ bụ Rashidi Yekini ugwu na ncheta ubọchị ọnwụ ya. Rashidi Yekini, nwụrụ n'abalị anọ nke ọnwa Mee afọ 2012 bụ onye kachasị enye goolu na Naịjirịa. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Coal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha ""Operation Puff Adder"" n'Enugwu Operation Puff Adder ndị Uweojii amịtawala mkpụrụ n'Enugwu.Commishịọna ndị Uweojii n'Enugwu bụ Sulaiman Balarabe egosiputala ndị oji-egbe ezu mmadụ asaa ndị uweojii gbanụ gbanụ bụ puff Adder jidere n'Enugwu. Ndị ejidere n'Udị gunyere Chibuike Charles onye udi, Okwudili Uzochi onye Ezeagu, na Mike Chibuode onye Amagunze. Anwụdere ha ka ha ji egbe anapụ ndị mmadụ ihe n'Udi. Ọ kpụpụtakwara ndị uweojii mmadụ anọ bụ ndị otu nzuzo Aiyes nke na enye nsogbu na mpaghara Enugwu. Komishịọna Balarabe kwere ndị Enugwu nkwa na Operation Puff Adder ahụ Onyeisi ndị uweojii bidoro izu uka ole ma ole gara aga bụ nke a ga eji kpochapụ ndị ohi n'Enugwu. Onyeisiala Buhari ga-alọta ka o si kwuo A na-ele anya na Buhari ga-alọta ozigbo emechara nzụkọ ahụ Ụlọọrụ onyeisiala agọọala na kepukepu na-efegharị nke gburu na onyeisiala agaghị alọta n'abalị ise nke ọnwa Mee dịka o siri kwuo n'ihi na ọ gara ọgwụgwọ ọrịa nala Briten bụ Ụgha. Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Shehu Garba kwuru na akụkọ ahụ bụ ihe ihere ma na asọ nti onyi. Ụmụ Naijiria na-ajụ ihe onyeisiala gara ime n'ala bekee kembe abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprelụ dịka ọ pụrụ na-edegara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ iji nyefe ọchịchị n'aka Osote ya bụ Yemi Osinbajo. Ha na-ajụkwa maọbụ ego gọọmenti ka ọ bụ ego akpa ya ka o jiri gaa njem ahụ dịka o kwuru na ọ bụghị ihe gbara ọchịchị ka ọ gara njem ahụ. Mana ndị ụlọọrụ ya kwuru na dịka ọ gafeghị abalị iri abụọ na otu, na ọdaghị iwu. Garba kwuru na onyeisiala nwere ikike si ebe ọbụla na-achị. Akụkọ gbasara Iyaloja Kọmputa Village Onye odeakwụkwọ otu jikọtara ndị na-ere akụrụngwa kọmputa n'ahịa Computer Village Legọs bụ Jerry Mba ekwuola na atụmatụ inye ha Iyaloja na Babloja bụ ụzọ ndị ala ahụ chọrọ iji kpachapụ Ndigbo ịbụ ndị isi ahịa ahụ. Ọrịa otoro na Mozambique Ebe a na-atụ ụmụaka ọgwụ mgbochi maka otoro na Mozambique N'ofesi, ọrịa otoro apụtala na Mozambique bụ ebe o jiderala mmadụ iri na anọ na obodo iri na otu na mba ahụ. Nke a mere ka ajọọ ikuku na idemmiri a kpọrọ Cyclone Kenneth kpachara mkpamkpa na mba ahụ. Caster Semenya sị na onweghị ihe pụrụ igbochi ya n'ọso Caster Semenya bụ nwaanyị dịka nwoke N'egwuruegwu, nwaada na-agbara mba South Africa ọsọ bụ Caster Semenya ekwuola na ọ bụ naanị olisa bị n'igwe ga-akwụsili ya ịgba ọsọ. Semenya kwuru nke a ka e merichere ya ka ọ kpụrụ IAAF n'ụlọikpe maka iweda ogogo mmiri ahụ nwoke akpọrọ testosterone na ahụ ụmụnwaanyị na-agba ọsọ. A na-eche na ike Semenya karịri ike ụmụnwanyị ibe ya bụ nke mere o ji akpagbu ha n'ọsọ mgbe niile. Akụkọ ga-amasị gị:" media-45937356,https://www.bbc.com/igbo/media-45937356,Uwazuruike akatọọla okwu Nnamdi Kanu,Uwazuruike akatọọla Nnamdi Kanu,"Onye ndu otu MASSOB bụ ralph Uwazuruike ekwuola na ogbo ya nke IPOB bụ Nnamdi Kanu anaghị achụso maka nwereonwe Biafra kama na ọ bụ nke onwe ya. Uwazuruike gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ige ntị na mgbasa ozi Kanu nke sịrị ka ha emeela ntulika n'afọ 2019. Ụlọikpe awụọla Fayose n'ala EFCC si na Ayo Fayose ji ha ụgwọ ị zara ọnu. Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose ga-aga n'ihu ị nọ n'aka ụlọọrụ EFCC dịka ụlọikpe ukwu dị na Legọs ekweghi atọhapụ ya. Ihe a bụ abalị ise Fayose nọ n'aka ndị EFCC n'ihi ebubo iri na otu banyere mpụ na nrụrụaka ego. N'ofesi Mba Saudi Arabia ekwetala n'eziokwu na egburu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi egbu nke butere oke ihe itimkpu na mba ụwa. Minista mba ahụ na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Adel al-Jubeir kwupụtara nke a ma gọọ na aka onyeisiala ha adịghị n'ọnwụ nwa amadị ahụ. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho agaghị anata ntaram ahụhụ maka ọgbaghara mere mgbe ha na Chelsea zutere n'izuụka gara aga. Otu FA ekwuola na ha adọọla Mourinho aka na ntị banyere agwa ọkpara n'oge ọgbaaghara ahụ. Nkeji n'abalị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta Nnamdi Kanu akpalitela mkparitaụka dị iche iche na social media Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ekwu uche ha gbasara ozi Nnamdi Kanu zipụrụ na Facebook ụnyaahụ. Social media na Naijiria nwurula ọkụ makana mkparịtaụka dị iche iche malitere ebe ụfọdụ ndị mmadụ kwetere n'ihe Kanu kwuru, nakwa ụfọdụ ekweteghị n'ihe o kwuru. N'ime ozi ya, Kanu kwuru na IPOB ka na-alụ ọgụ inweta ala Biafra nakwa na agaghị enwe ezumike ma ọ bụrụ na Biafra apụtaghị dịka ala nwere onwe ha. NLC na-enwe iwe ọkụ Otu na-ahazi ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ha ga-ebido abụbụ ọrụ n'ụbọchị isii n'ime ọnwa Novemba ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe gosiri na ha ga-akwụ ha ụgwọ opekatampe ruru puku naira iri atọ. Ha kwuru na abụbụ ọrụ a ga-abụ nke kachasị ukwu na Naịjirịa. Mmadụ 30 emerụọla ahụ na Canada Mmadụ ruru iri atọ na-eme mme mme na mahadum Clemson n'obodo California na mba Amerịka emerụọla ahụ oge ala ha kwụ ọtọ n'elu ya dakpuru n'ime. Ndị gbatagbata kwuru na ọtụtụ mmadụ gbajiri ọkpụkpụ dị iche iche na ya bụ mberede. Kimi Raikkonen emeriela Lewis Hamilton N'egwuregwu, Kimi Raikkonen emeriela onye ọkwọ ụgbọala bụ Lewis Hamilton, n'asọmpị US Grand Prix. N'asọmpị Premier League, Arsenal na Leicester City ga-asụkọta isi n'elekere asatọ nke abalị taa. Gee nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Peter Obi: Ndigbo so na ndị wulitere Naijiria" afirika-51805194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51805194,Africa Eye: Etu e si agbanwe ọhịa ọ bụrụ ịkpa site n'ohi osisi Rosewood,"Agbaneghi na Gambia egbuchara osisi Rosewood ha, ha na-are ya bu osisi aghara aghara.","Nyocha BBC mere na-egosi na o bu na mba Senigal ka osisi ndi a si. Senigal amachiela ire osisi a, mana ndi mmadu na-eji abali bịa gbute ya ma buru ha ga Gambia gaa ree ha. Nke a na-ebute mmebi ọhịa." afirika-48747349,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48747349,Fulani Herdsmen: 'Gọọmentị Anambra ma ọchịehi Fulani niile nọ steeti a' - Kọmịshọna mgbasaozi,Okwu mwakpo awakporo obodo Anam bụ ihe ndị Anambara kpụ n'ọnụ.,Ụfọdụ mmadụ gara n'ihu boo gọọmentị steeti ahụ ebubo ịnye ndị ọchịehi Fulani ala. Don Adinuba kwụchitere gọọmentị ọnụ ma kọwa etu ihe sịrị dị. Gee ya ntị n'ihe nkiri a. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-50451524,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50451524,David Lyon nke APC emeriela PDP n'okpuru ọchịchị 6 n'ime 8 dị na Bayelsa steeti,"Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati ""All Peoples Congress"" (APC) na Bayelsa Steeti bụ David Lyon ejirila vootu 352552 buru onyeisi na ntuliaka eji họpụta aka ga-achị steeti ahụ ruo afọ anọ n'abịa.Onye gbara nke abụọ bụ Diri Duoye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati ""Peoples Democratic Party"" (PDP) bụ onye nwetere vootu 133172.","Ya bụrụ na Inec akpọ ya dịka onye meriri, David Lyon ga-anara Maazị Serike Dickson ọkwa dịka gọvanọ nke ise ga-achị steeti ahụ kemgbe ọchịchị onye kwuo uche ya laghchitere n'afọ 1999. Maazị Duoye Diri nke PDP Njem Maazị Lyon na ntuliaka a mere ka ihe bịara na njedebe tupu Ụlọikpe Mpesa pụtara n'ụbọchị nke 15 nke ọnwa Nọvemba sị ka Inec ghara ịnabata mkpebi Ụlọikpe Ukwu na Bayelsa sị ka Inec wepu aha ha. Ka ọ kwụ ugbua, Inec kpebiri na aha pati APC ga-esonye na ya bụ ntuliaka makana adịghị enwe aha mmadu na akwụkwọ ntuliaka. Dịka Ụlọikpe siri kwuo, na-agbanyeghi ihe ọbụla, Lyon ka bụ onye na-efere APC ọkọrọtọ na ntuliaka nke pụtara na o bụ ya ga-anara asambodo mmerị. Ihe bụ mbụ a ga-anapụ ọchịchị n'aka PDP na Bayelsa kemgbe 1999. Akụkọ ka na-abịa." 46727232,https://www.bbc.com/igbo/46727232,New year Message 2019 : Ihe ndị miri emi Buhari kwuru maka afọ ọhụrụ,Aka na-achị Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka obi ụmụ Naijirịa dere duu maka ntuliaka na-abịanụ n'ihi na ọgaghị abụ tigbuo zọgbuo.,"O kwuru nkea na ozi afọ ọhụrụ ozipuru ha. N'okwu Buhari, ""afọ 2019 dị ezigbo mkpa maka ọtụtụ ihe ga-emere Obodo Naịjirịa."" Ọ rịrịọrọ ka ụmụ Naịjirịa jiri ohere a wee tụgharịa uche na ihe ọma ole na ole mere n'afọ 2018 , nke ha nwetere na nke ha enweteghị ma were ohere ahụ kelee Chukwu. Ihe ndị ọzọ o kwuru Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52573270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52573270,"'Asymptomatic', 'Lockdown' na okwu ndị ọzọ coronavirus gbara n'anwụ",O ruola ọnwa ise ọrịa coronavirus nke a kpọrọ Covid-19 malitere ịcha ụwa ọkụ.,"N'ime ọnwa ise a, ọtụtụ mmadụ anwụọla, ọtụtụ mba emechiela ebe okwu dị iche iche gbalitere eru ma bụrụ mbụ ụfọdụ ndị mmadụ na-anụ maka ha. Ụfọdụ okwu ""ọhụrụ"" ndị a bịara dị ka ọgbara Igbo gharịị makana ọtụtụ ndị ọ bụ mbụ ha ị nụ ya aghọtaghị ihe ya bụ okwu na-akọwa. Mana ugbua a ị batara n'akụkọ a, ụjọ atụla gị ma ọ bụrụ na okwu ndị a na-ada gị ka igwe na ntị, makana BBC Igbo ga-akọwara gị ya etu ị ga-esi ghọta ya ugbua. Okwu ndị so coronavirus Pandemic: Nke a bụ nke a na-akpọ ọrịa ozuru ụwa ọnụ n'Igbo. Njirimara ya bụ na ọ bụ ọrịa na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ ma na-agazu ebe dị iche iche dịka n'obodo ruo obodo maọbụ site na mba fere na mba n'otu oge. Ụzọ ọzọ e nwereike isi akọwa ya dị ka ilu Igbo na-ekwu na ""onye a na-agwọ ibi ọ na-eto afọ"". Index case: Nke a bụ ihe a na-akpọ onye mbụ butere ọrịa na-efe ọtụtụ mmadụ. Ọ bụ onye na-egosi na e nwere ọrịa na-efe efe. Marakwa na ọ bụghị iwu na ọ bụ onye ahụ butere ya bụ ọrịa, kama na o nwereike ịbụ onye ahụ ka e nyochara wee hụ na ọ bụ n'aka ya ka ọrịa a si gafee n'ahụ ndị ọzọ. Herd immunity: Nke a pụtara nchekwa a na-enye ọha iji gbochie mfesa ọrịa ọkachasị ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anatala ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa. Nke a na-enyere aka ịhụ na ọrịa na-efe efe efesaghị ruo ndị na-ebutebeghi ya, n'ihi na ndị ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje ọgụ nke bụ ""immunity"" ha na-arụsi ọrụ ike nwereike inyere aka ikpuchite ndị nke dị n'ahụ ha akaghị aka. Tupu ịpụọ n'ezi, gbaa mbọ jide ihe anọ ndị a Community transmission: Nke a bụ mgbe mmadụ na onye bu ọrịa na-efe efe enweghi mmekọrịta mana o butekwa ya bụ ọrịa. Ụfọdụ oge ọ bụrụkwa na onye ahụ esighikwa mba ebe ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-akpa ike, mana o burukwa ya bụ ọrịa. Lockdown: Nke a ka a na-akpọ mmechi obodomaọbụ mmachibido ịpụta ezi. Ihe ọ pụtara bụ na ndị na-achị obodo ahụ na-etinye iwu ịkwụsị ndị mmadụ ịpụta ezi. Nke a bụ otu ụzọ e si egbochi mfesa ọrịa n'oge coronavirus a. Ọtụtụ mba gụnyere Naịjirịa kpọchiri mba ha makana ndị mmadụ nọrọ n'ime ụlọ ghara inwe mmekọ, o nyere aka ibelata etu ọrịa si efesasị. 'Ụmụnwaanyị atagbuola onwe ha n'ahụhụ n'ihi mkpọchị obodo' Vaccine: Nke a bụ nke a na-akpọ ọgwụ mgbochi n'Igbo. E nwere ụdịrị dị iche iche a na-enye maka igbochi ọrịa dị iche iche. Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ọgwụ mgbochi a ga-eji agwọ ọrịa covid-19. Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus? Flattening the curve: Nke a bụ mgbe ndị mmadụ gere ntị n'usoro e ji egbochi ọrịa na-efe efe dịka ịnọ n'ụlọ ghara ibute ma fesasịa ọrịa a. Ndị mmadụ gee ntị ma si usoro dịka ""mmachibido ịpụta ezi"" ọ ga-eme ka ọnụọgụgụ mmadụ ole ga-ebute ọrịa a ghara ibu oke ibu, ma ghara iju ndị na-arụ ọrụ ahụike aka. Ọ dị ka ebe ndị ọrụ ahụike na-asị gị ""nyere m aka ka m nwekwaa ike inyere gị aka"". Immune system: Nke a bụ ihe dị n'ime ahụ mmadụ na-alụso nje na ọrịa ọgụ. Ọ bụghị oge niile mmadụ na-arịa ahụ ka o kwesịrị ịṅụ ọgwụ. Ndị ọkammụta sayensị na ihe gbasara ahụike na-ekwu na ụfọdụ oge ọ na-adị mma iji nri na-edozi ahụ akwalite ime ahụ gị ka ị gbasie ike ma nwee ike ibuso nrịanrịa agha na-aṅụghị ọgwụ ọbụla. A na-eji akwụkwọ nri, mkpụrụosisi nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche akwalite ime ahụ mmadụ iji chebiri mgbe ọrịa dị aṅaa ga-ewelite isi. Asymptomatic: Nke a bụ mmadụibu ọrịa na-efe efe mana ọ naghị egosi ya n'ahụ.Etu a ọrịa coronavirus na-efegharị, e nwere ụfọdụ ndị bu ya mana ọ naghị egosi n'ahụ ha, ọ naghị akutu ha, ha na-agara ụwa ha mkpa ha. Isolation: Nke a bụ ịkpọpụ onye bu ọrịa na-efe efe n'ime otu ebe e wepụtara maka nlekọta ha, ka ọ ghara ibunye ndị ọzọ ya bụ ọrịa. Ụfọdụ oge ọ na-abụ n'ụlọogwụ, ụfọdụ oge ọ bụrụ ebe a rụpụtara maka nlekọta ndị bu ọrịa. Self-isolation: Nke a bụ ọnọdụ nnọrọ onwe, mgbe onye na-enyo ma o nwereike ibu ọrịa a maọbụ onye bu ọrịa a ga-ejiri aka ya chịba ụkwụ n'ụlọ ghara ịpụta ezi, gbajọọ ya na ndị ọzọ inwe mmekọ nakwa ime ihe ndị nwereike ime ka o bufee ndị ọzọ ọrịa. Onye ahụ ga-anọrọ onwe ya naanị ya; ọ ga-azụrụ nri ya n'ịntanetị maọbụ jiri ekwentị zụta ma nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị ya mkpa, ghara ịpụta ezi. Uru na ọghọm dị na mmadụ isi n'ụlọ arụ ọrụ Quarantine: Nke a bụ mgbe a kpọpụrụ onye ya na onye bu ọrịa na-efe efe nwere mmekọ, iji lelee ya ma hụ ma ọ ga-ebutekwu ọrịa ahụ, ma mekwaa ka ya na ndị ọzọ ghara inwe mmekọ mgbe a na-elele ya. Onye a na-etinye na ""quarantine"" bụ onye nwereike ọ maghị na ya na onye bu ọrịa a enweela mmekọ, maọbụ na o bu ọrịa a mana ọ naghị egosi ya. Social-distancing: Nke a bụ ịgbara ndị mmadụ ọsọ ka gị na mmadụ ghara inwe mmekọrịta makana ị maghị onye bu ọrịa na-efe efe. Nke a bụ na ị nwereike ịpụ apụ mana ị gaghị aga mmadụ nso, o kwesịghị ka onye ọzọ jiri ihe dị ka mita abụọ ruo isii ruo gị nso. Coronavirus Tips: 'Social Distancing' ga-enye aka ịkwụsị mgbasa coronavirus Palliative: N'ezie, ""palliative"" bụ nlekọta a na-enye onye nwere ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ iji mee ka ihe mgbu ya belata, mana na Naịjirịa, ọ bụ ihe gọọmentị na-akpọ enyemaka a na-enye ndị enweghị etu ọ forọ ha ka ha wee nwee ike jikwata onwe ha. Ọ bụ ihe gọomentị na ụfọdụ ndị mmadụ na-eke ndị nọ n'ụbịam ka ha nwee ike ji chedo afọ ha n'oge ""ụwa yagara ayaga"" a. Gọọmentị nyere anyị ihe niile anyị ga-eji nọrọ n'ụlọ - Ndị Naịjirịa bi Amerịka Stimulus package: Nke a bụ ihe gọọmentị ji enyere ụfọdụ ndị ọ na-achị aka n'oge ihe ndapụta dịka ugbua ọrịa ozuru ụwa ọnụ na-efegharị. Ọ bụ ihe ụzọ a ga-esikwa kwalite akụnụba obodo n'ihi na ego ahụ a ga-enye ndị mmadụ iji nyere ha aka oge ihe ndapụta ga-alaghachikwa n'akụnụba obodo. Hand sanitizer: Nke a bụ ihe e ji ehicha aka nke nwere mmanya ọkụ, nke na-enyere aka ibelata nje mmadụ nwereike iji aka metụta. Etu e si eme 'hand sanitizer' Curfew: Nke a bụ mmachi ngagharị maọbụ oge apụla ezi n'asụsụ Igbo. N'oge mfegharị ọrịa coronavirus a, gọọmentị dị iche iche etinyela mmachi a ka ha gbochie ndị mmadụ ịpụ ezi aghara agahara ka ọrịa a ghara ifesasị metụta ndị ebughi ya. N'ụfọdụ ebe na Naịjiria e tinyere iwu sị ndị mmadụ apụla ezi site n'elekere asatọ nke abalị ruo nke isii nke ụtụtụ. Personal hygiene: Nke a bụ ọnọdụ nlekọta onwe, ebe mmadụ ga-eji aka ya hazie ma debe onwe ya na gburugburu ya ọcha. Idobe onwe gị na gburugburu gị ọcha ga-enyere gị aka igbochi ụfọdụ ọrịa na nje nwereike ife mmadụ. Face masks: Nke a ka a na-akpọ akwa mkpuchi imi n'asụsụ Igbo. Mara ma mask ọ ga-egbochi gị ibute ọrịa Coronavirus A na-eji ya egbochi ihe dịka ikuku aja na ikuku ọjọọ ndị ọzọ ikubanye mmadụ n'imi. Ọ na-egbochikwa ihe dịka azụzụ, ụkwara, asọmmiri na ihe ndị ọzọ onye ọzọ kwapụtara ịtụsa gị n'imi na ọnụ, ọkachasị nke onye bu ọrịa na-efe efe." afirika-45041768,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041768,Saraki: Oshiomhole sị na onyeisi ụlọomeiwu ukwu kpu okpu eze ha,Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) bụ Adams Oshiomhole gwara ndị ntaakukọ n'Abuja na aka na-achị ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwesiri ị dee akwụkwọ arụkwaghị m dịka onyeisiụlọ omeiwu ukwu ngwa ngwa makana ọ pụrụ na APC gawa Peoples Democratic Party (PDP).,"Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Oshiomhole kwuru nke a na ngwucha ọgbakọ ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na kwa ụfọdụ ndị gọvanọ na sinetọ APC mere ụnyaahụ n'Abuja. O kwusiri ike na Saraki kwesiri ị kwanyere onwenya ugwu, na kwa dee akwụkwọ a, makana ọkwa dị ya n'isi dịka onyeisịụlọ ọmeiwu ukwu bụ makana ọ bụbụ onye otu APC, bụ ndi kachasị na ụlọomeiwu. N'ọnụ okwu Oshiomhole: ""Okpueze a bụ akụ nke otu APC. Ọ bụrụ na Saraki bụ onye nwere nsọpụrụ o kwesiri ị dee akwụkwọ a"" Nsogbu kadị n'APC Aminu Tambuwal bụ gọvanọ Sokoto steeti kwuputara na ya apụọla na APC gawa PDP. O bụ ya bụ gọvanọ nke atọ pụrụ n'APC gawa PDP. Cheta na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom na Abdulfatah Ahmed, bụ gọvanọ Kwara, pụrụ n'APC gawa PDP. Saraki na ndị APC bidoro nkatọ onwe ha ka mgbe ọ banyere oche ọchịchị dịka onyeisiụlọ omeiwu ukwu Ihe ndị mmadụ na-ekwu na Twitter Okwu nke a Oshiomhole kwuputara butere mkparita ụka na Social Media. Na twitter, otu nwoke aha ya bụ Nkoro Macilinus kwuru na oge eruola APC ga hapụ Saraki. Ọ gbakwara ajụjụ ọnụ na ọ bụ zị njọ na Sarakị pụrụ na APC gawa PDP? Onye ọzọ aha ya bụ Adam Yusuph dere na ọ gbagwojuru ya anya na Oshiomhole na-ekwusi ike na okpueze onyeisi ụlọmeiwu ukwu bụ akụ nke APC. O kwukwara na udi okwu a bụ ihe na-emebi ọchịchị gọọmentị Mana Maina Yahumi dere na onye ọbụla kwadoro onweya ugwu ga-eme ihe a Oshiomhole na-ekwu ugbua. Akụkọ banyere ntuliaka 219 ka na-apụta, anyi ga-ewetara unu ha mgbe anyi wetere ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43321074,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43321074,'Ụmụnwaanyị anyị kajara akaja',Charly Boy kwuru na ụmụnwaanyị dị mkpa.,O kwukwara ihe ndị na-amasị ya ebe nne ya nọ na ụdịrị ihunaanya nne ya nwere ebe ya na umunne ya nọ. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho Akụkọ ọzọ ga-amasị: afirika-44749734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44749734,Akụkọ kachasị n'ụtutu a: CAN akagbuola ngagharị iwe ha hibere,Akụkọ ndị dị mkpa n ' ututu a,"Dino Melaye 'etiela egwu' End of Instagram post, 1 Sinetọ Dino Melaye emeela ihe e ji kpụrụ ya n'ọnụ ọzọ. Dino Melaye etiela egwu ọzọ ebe ọ jara otu pati PDP mma na-asị na ọ chọrọ ịlaghachị, ma kwuo na APC ataala ya ahụhụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Dino Melaye: Onye omeiwu ukwu etiela egwu ọzọ CAN na NSCIA etinyela ọnụ n'okwu ogbugbu ndị mmadụ Ngalaba a kpọrọ Nigerian Supreme Council of islamic affairs agwala gọọmentị etiti ka ha gbaa mbọ hụ na nchekwa ruru ime obodo, maka ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa, ma na-akatọ okwu dị iche iche ndị ụkọchukwu na-ekwu maka ya. Nke a na-eme ka ndị otu Christian Association of Nigeria kagburu ngagharị iwe ha chọburu ime n'ụbọchi iri na otu nke ọnwa a gbasara oke ogbugbu na Naịjirịa. Ha sị na ọ ga-adịba ruo mgbe a mara ọkwa ọzọ. Onyeisi ha bụ Samson Olasupo Ayokunle, kwuputere nke a ụnyaahụ n'akwụkwọ ndepụta, ebe o kwukwara na ha ga-eme ekpere na ibuọnụ ụbọchị atọ n'ụlọụka niile dị na Naịjirịa nakwa ngalaba CAN niile dị na steeti niile, nke ga-ebido n'ụbọchị Julaị 9 ruo Julaị 11. N'akụkọ mba ofesi Ngalaba na-elebanye anya na kemịkal e ji eme ngwaagha a kpọrọ ""Organization for the Prohibition of Chemical Weapons"" na Bekee, e kwuola na ọ bụ klorine ka ndị omekome jiri wakpoo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo Douma dị na Syria n'ọnwa Epreelụ. Ịji cheta ka ihe a si mee n'ọnwa Epreelụ, gụọ ya ebe a Ọgụ Sirịa: Ngwaagha kemịkal egbuola ọtụtụ ndị mmadụ N'egwuregwu, N'egwuregwu, ka a gbapụrụ Brazil n'asọmpi Iko Mbaụwa ụnyaahụ, onye nchịkọta ha bụ Tite, ekwuola na ha pụrụ maka na Belgium bụ ndị ha zutere, gbakarịrị ha. N'otu aka ahụ, cheta na Ingland na Swiden ga-ezute ibe, ebe Rọshịa na Kroeshia ga-asọ mpi ịmata ndị ga-agafe agba ọkara Ikpeazụ. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Illbliss maka Biafra." afirika-53795689,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53795689,Lyon na Mancity: Ntakịrị Lyon agbanyụọla 'mic' ndị Manchester City,Otu egwuregwu bọọlụ Olympique Lyon azaala ogbu agụ ọzọ dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu dulaa Manchester City n'asọmpi Champions League n'abalị Satọde.,Ọgbaa bọọlụ onye Lyon sị Aịvori Kost bụ Maxwell Gnaly Cornet ebe ọ na-aṅụrị Cheta na ọ bụ Lyon dulara Cristiano Ronaldo na ndị Juventus n'asọmpi a n'izu gara aga. Cornet nyere otu goolu ebe Mousa Dembele nyere goolu abụọ Lyon ji merie. Kevin de Bruyne bụ onye nyeteere Man City otu goolu ha ji gbaa aka ahịa. Nke a pụtara na ọ bụ Lyon na Bayern Munich ga-ezute onwe ha iji mara onye ga-etozu iso gbaa asọmpi nke ikpeazụ nke iko Uefa Champions League. afirika-45874135,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45874135,Akụkọ ndị dị mkpa taa: Nwaanyị a ga-aka nwoke chịta nke ọma,Akụkọ dị mkpa taa Na mba ofesi,"Ọ pụtara na aka ụmụnwaanyị ka kwụọtọ karia nke ụmunwoke? Aisha Mohammed bubu minista na-ahu maka ọrụ tupu onye na-ahụ maka nchekwa Ọ bụ ihe Praim Minister mba Ethiopia na-ekwu dịka o mere Aisha Mohammed onyeisi ndịọrụ nchekwa mbụ ma nyekwa ụmụnwaanyị ọkwa ọchichị ruru ọkara na gọọmentị ya. Red Cross ebeela akwa Hauwa Liman. End of Twitter post, 1 Onyeisi Red Cross na mpaghara Afrịka bụ Patrcia Danzi ekwuola na ọnwụ Hauwa Liman bụ ihe obi mgbawa Danzi rịọrọ gọọmentị Naịjirịa ha gbaa mbọ hụ na udiri ihe a emeghị ọzọ. EFCC si na Ayo Fayose ji ha ụgwọ ị zara ọnu. Aka chịbụrụ Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose wụchiri n'ụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC taa. Fayose mere nke a dịka eduru onye nọchịrị anya ya bụ Kayode Fayemi n'iyi ọrụ n'Ekiti taa. N'egwuregwu, Otu bọọlụ Madagascar etozuola ịga asọmpị Africa Cup of Nations nke mbụ ha dịka ha meriri otu bọọlụ Equitorial Guinea. Ndị Super Eagles nke Naịjiria ga-ezute otu boolu mba Libya ta na Tunisha. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụtụtụ Aga m ebu akwa ndina gaa n'ụlọọrụ EFCC E meriri onye osote Gọvanọ Fayose bụ Kolapo Olusola-Eleka na ntuliaka gọvanọ e mere n'Ekiti na nso nso a. Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fasoye ekwuola na ọ ga-ebu ote ya na akwa ndị na niile ya gaa zara ọnụ n'ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC. Cheta na e boro ya ebubo na ọ na-atara ego dị otu ijeri naịra na ọma bụ nke ekwuru onye bụbu onye ndụmaọdụ na nchekwa bụ Sambo Sinatọ Musilu Obanikoro nyere ya. Ọrụ Fayose dịka gọvanọ gụrụ n'isi ụtụtụ taa nke a mere ikike na-echekwa bụ immunity na bekee ị gaara ọnụ ya gụkwara n'otu aka ahụ. Naịjirịa akatọọla ogbugbu Leman: Ndị Boko Haram gburu onye ọrụ Red Cross bụ Hauwa Leman ka ọ gachara otu ọnwa ka kwụrụ ka atọhapụ ndị otu ha eji eji. Ụmụ Naịjirịa akatọọla gọọmentị etiti maka ịnọ na mmiri ncha a baa ha anya n'ihi ogbugbu ndị Boko Haram gburu Hauwa Leman onye ọrụ Red Cross. Cheta Boko Haram tọọrọ Leman na ndị oru ibe ya n'ọnwa Maachị afọ 2018. Akwamozu nwafọ Igbo uweojii mba Amerịka gburu Taa bụ akwamozu Chinedu Okobi, nwa afọ Igbo dị afọ iri atọ na isii ndị uweojii mba Amerịka gburu n'anyaọcha na mba ahụ. Nwanne ya bụ Ebele Okobi gwara BBC Igbo na aka nwanne ya dị ọcha, ma kpọkuo mba ụwa ka ha nye ezinaụlọ ha aka inweta ikpe kwụ ọtọ. N'ofesi Odeakwụwkọ mba Amerịka bụ Mike Pompeo ga-ezute Eze Salman Amid nke Saudi Arabia taa n'ihi ogbugbu onye ntaakụkọ Saudi a kpọrọ Jamal Khashoggi furu n'ụlọ ọrụ nnọchiteanya ha dị na Turkey. N'egwuregwu, England ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Spain n'asọmpị mba Uefa ha gbara n'abalị mmeri a bụ mbụ England na-enweta n'aka mba Spain n'ime afọ iri atọ na otu. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Oby Ezekwesili: 'M ga-agba mgba dị na ndọrọndọrọ 2019'" afirika-53724469,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53724469,Diezani Allison-Madueke: Ndụmọdụ o nyere ndị Yahoo-Yahoo akpaliela iwe ndị mmadụ,Diezani Allision-Madueke bụbu Minista na-ahụ maka njem tupu o nwete ohere rụkwa ọrụ dịka Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị tupu ọ bụrụ onye ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na mpụ bụ Economic and Finaincial Crimes Commission (EFCC) na-akpụkarị n'onu banyere nrụrụaka n'ọrụ ọha.,"Odoziaku Allision-Madueke, bụ nwunye aka chịbụrụ Anambra steeti n'oge ndị agha bụ Allision Madueke, rapụrụ Naịjirịa gawa Briten ka ọchịchị Goodluck Jonathan na-abịa na njedebe. Kamgbe ahụ, EFCC ebola ya ebubo na aka ya dị na nde naịra 362 a na-achọ achọ n'akụnụba Naịjirịa nke ha siri a chọrọ iji mee ka ntụlkịaka emere ganyere ha. EFCC chọrọ ka Diezani si ofesi lọta Naịjirịa bịa zara ọnụ ya. Ha natakwara ụlọikpe ikike ka gọọmentị napụ ya ọlaedo ya ruru nde dọla 40. Ọtụtụ ụlọ Allison-Madueke nọkwa gọọmentị Naịjirịa n'aka, mana o kwebeghi ịlọta Naịjirịa, nke mere ikpe niile a na-ekpe ya na-eme n'azụ ya. Mana, dịka okwu nke ahụ ka nọ n'elu ekwu ọkụ asụ pụtụpụtụ, Allison-Madueke malitere iwu ọzọ na Twiter Naijirịa dịka o mere ihe onyonyo o ji adọ ụmụ okoroọbịa Naịjirịa aka na ntị ka ha kpachara anya ha banyere nrụrụaka eji Yahoo Yahoo mara. Ụfọdụ mmadụ ji iwe saa ihe a Allison-Madueke dere site were na-ekwu na onye nwere azịza banyere mpụ ekwesịghị ịnye ndụmọdụ banyere ịkwụsị mpụ. Ebe ka ọ nọ kwuo okwu a? Ọ bụ na otu emume otu a kpọrọ ""Ijaw National Development Group"" haziri ka Allison-Madueke nọ kwuo okwu a dịka ọ na-etinye ọnụ n'okwu omenala. Ọ sị: ""ihe mere ndị mmadụ ejighi eso omenala eme ihe ziri ezi bụ na ha na-eji ndị na-eme Yahoo Yahoo eme ndị ha na-akwanyere ugwu."" Allison-Madueke kwukwara na ọ bụ ndị na-eme nrụrụaka n'ịntanetị na-enye Naịjirịa ajọ aha. Aka Chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan sokwa gaa ya bụ emume emere n'ịntanetị." afirika-46782009,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46782009,Nigeria Election 2019: Ihe a na-ekwu maka Peter Obi n'obodo ya,"BBC Igbo gara Agụlụ n'Anambara steeti bụ obodo Peter Obi, onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'okpuru pati PDP.","Ndị ha na Obi so gụọ akwụkwọ site na Praịmarị ruo ma mahadum, kwuru ihe ndị dị ịtụnanya gbasara ya, nke bụ bụ na a mara ya dịka ""Okwute"" N'okwu ha, ọ malitere ịchụ ego dịka nwa akwụkwọ praịmarị, oge ọ na-ana ha ego tupu ọ rụọrọ ha ọrụ ha kwesiri ịrụ. Ha kwukwara na ọ bụghị onye kwenyere n'inye mmadụ ego, mana ọ bụ onye ga-akwado gị n'ọrụ ị na-arụ ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ ziri ezi. Ha kwuru na ọ bụghị onye na-emefu ego." egwuregwu-44488542,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44488542,World Cup 2018: Lee ndị pụtara n'ala Rọshịa taa,Oge ahụ abịala oo. Anya niile na-ele anya n'isi obodo Rọshịa bụ Mọsko maka iko mba ụwa na-eme ugbua n'ebe ahụ.,Mba 32 sị mpaghara dị iche iche n'ụwa ga-asọ mpi ruru 64 tupu anyị amatra onye ga-ebu iko a n'ụbọchị 15 n'ọnwa Julai. Puku kwuru puku mmadụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị eruola Rọshịa ma na-egosikwa uwe dị iche iche maka inye otu dị iche iche otito. Lee ụfọdụ ihe ndị mmadị na-eme n'ala ahụ Asọmpị iko mba ụwa na-atọ ndị a dịka mmanya ọkụ. Nwata nwaanyị a na-akwado ala ya bụ Rọshịa n'ụzọ pụrụ iche. Ndị ihe ndị otu Saudi Arebia na-amasị sokwa na ndị na-akwado otu a n'ime ọgbọ egwuregwu Luzhniki na Mọsko. Ngwa nụ oge 'Selfie' eruola!! Ụmụ nwaanyị mara mma sokwa. afirika-52302784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52302784,Coronavirus in 60 seconds: A na-agwọta coronavirus agwọta?,Ọtụtụ ndị mmadụ n'akụkụ ụwa niile agbakeela nke ọma n'ọrịa coronavirus.,"Mana ụfọdụ ndị mmadụ ka na-akpaso ndị dị otu a agwa ọjọọ. Ha na-eche na anaghị agwọta coronavirus agwota, nke na onye gbakerela n'ọrịa a ka nwekwara ike ibufe ya ndị mmadụ. Nke a abụghị eziokwu. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu, Adline Okere, Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi" afirika-45366089,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45366089,Ebuka: Ndị mmadụ akpụrụla odogwu n'ejiji n'ọnụ ọzọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa na mgbede a,"Ebuka Obi-Uchendu onye na-ekwu okwu n'onyonyo ewuwela ọzọ na soshal midia tta. Ndị mmadụ na-ekwu ihe na-atọ ọchị maka ejiji ojiri iji du ndị mmadụ na nturugo ihe onyonyo n'Afrịka taa. End of Twitter post, 1 Lee ihe o kwuru mgbe o wuru na agbamakwụkwọ Prince Harry na Meghan Markle. Ihe mere m jiri wuo n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan. Ọzọ, Gọọmentị etiti ekwuola na mba Naịjirịa na mba Chịna ga-ebinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ga-ebute dọlla nde narị atọ n'ọma maka mmepe obodo. Ebe ego a nke ụlọakụ China Exim ga-ewepụta ga-abanye kachasị nrụpụta ngalaba teknụzụ dị ịcheịche n'ala Naịjirịa. Okwu PVC Iwe ji ndị anatabeghị PVC n'Enugwu Dịka Inec kwuru na ha agaghị adọtị oge ha nyere maka ịnata akwụkwọ PVC ndị mmadụ etiele mkpu enyemaka n'Enugu steeti Ha kwuru na ndịọrụ ndenye aha ezughi nakwa na enwere sọsọ otu ụlọọrụ n'ụfọdụ okpuruọchịchị na steeti ahụ nke mere na ndị mmadụ na-emefu oge ebe ha na-eche ị denye aha. Ihe mwute, Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Onye nọ ebe akụkọ mere gwara ụlọọrụ ntaakụkọ afp na ndị oyindụegwu ji gwongoworo nakwa ngwa agha dị icheiche wakpo ọdọ ndị agha nke ndị na obodo Zari Borno steeti. Ọ kọwara na ha na ndịagha Naịjirịa lụrụ ọgụ ruru otu elekere tupu ha alaghachi azụ Zari bụ obod dị n'oke Niger na Naịjirịa. Na mba ofesi, Barack Obama agwaala ndị mmadụ ha ṅomie John McCain ebe ya na George Bush bụ ndị chịbụrụ mba Amerịka kwanyere John McCain ugwu ikpeazụ n'akwamozu ya. John McCain nwụrụ n'ịzuụka gara aga dịka ọ rịachara ọrịa akpụ nke metụtara ya n'ụbụrụ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Liverpool aghọrọla odogwu dịka ha meriri otu Leicester city ọkpụ abụọ asatara otu mgbe ha zụkọrọ taa. O nweghi onye meriri Liverpool n'etiti Brighton, Crystal Palace nakwa West Ham bụ ndị ha zuterela na mbụ. N'ụtụtụ Kemikal na-ebu ọrịa kansa nọrọ n'ime akwa akwụkwọ - SON Ngalaba na-enyocha ihe a na-emepúta ma ọ dị ezi mma bụ Standards Organisation of Nigeria adọọla ndị na-atụbata akwa ụmụakwụkwọ n'ime Naijiria aka na ntị maka ịtụbatta aa nke nwere otu kemikal na-ebute ọrịa kansa. Ha kwuru na kemikal a dị n'ime akwa ụmụakwụkwọ ụlọọrụ Sing Shun Fat School-Clothier Company na Zenith Uniform Company na-emepụta na China. INEC emechiela odide aha n'akwụkwọ ntuliaka n'afọ a Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ha agaghị agbati ohere ha nyere ndị mmadụ iji denye aha n'akwụkwọ ntuliaka a kpọrọ PVC n'aha ichafu karịa ụbọchị ha hiwere maka ya. Odeakwụkwọ INEC bụ Rotimi Oyekanmi kwuru na nke a bụ iji nye INEC ohere ịkwadobe ihe niile e kwesiri ime tupu mbido ntuliaka nke 2019 nke ọma. Mana ha ga-alaghachi na inye PVC na ngwụcha yabụ ntuliaka. Vanessa Marquez anwụọla Na mba ofesi, ndị uweojii na Kalifonia nke mba Amerika agbagbuola otu nwaanyị onye ihe nkiri só n' ihe nkiri Ameríka ama ama bụ 'E-R' aha ya bụ Vanessa Marquez. Ha gbagburu Marquez nwere ọrịa isi maka na o chere ndí uwe ojii egbe n'ihu oge ha gara be ya. Serena emeriela Venus N'egwuregwu, Serena Williams emeriela nwanne ya tọrọ ya bụ Venus Williams n'asọmpị US Open. Serena jir agba were banye agba nke anọ n'asọmpị a. Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Abịa n'obodo ndị kacha mma ibi n'ụwa, Sydney, Vancouver, Ọsaka nakwa Toronto so na ndị kacha mma, ebe Legọs, Karachi na Dhaka so na ndị kacha njọ. Lee obodo kacha mma ibi n'ụwa" afirika-46664542,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46664542,CAF Confederations Cup: Rangers Enugu akpaala ndị mmadụ obi aṅụrị,"Akụkọ dị mkpa taa N'egwuregwu,","Rangers International meriri otu USM BEL ABBESS nke mba Ọljiria n'asọmpi egbe buru ọ laa na nke CAF Confederations Cup, n'Enugwu. End of Twitter post, 1 Goolu abụọ Bright Silas gbakpuru n'ọkara nke mbụ n'asọmpi ahụ nyere ha mmeri mere ka ha tozuo. Rangers ga-ezute onye ọbụla e meriri n'asọmpi agba ngwụcha nke Champions League n'egbe buru ọ laa, iji nweta ohere isonye na ""group stage"". Ebe Lobi stars meriri Gor Mahia nke Kenya iji ruo ihe Bekee kpọrọ ""Group stage"" n'asọmpi Iko Afrịka a kpọrọ CAF Champions League, nke mere ya mbụ ha na-eru ọnọdụ a kemgbe afọ 2000. Ọkụ gbara ụlọọrụ achụmnta vootu APC n'Enugwu, Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ọkụ gbara ebe George Tagbo Ogara na-azọ ọchịchị gọvanọ Enugu steeti, ji mere ụlọọrụ achụmnta vootu ya na ụgbọala abụọ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC na ha na-esi imi n'ala inyoputa etu ọkụ a si bido. Nzukọ Ecowas e mere n'Abuja, Na nzukọ Ecowas e mere n'Abuja, Onyeisiala Muhammadu Buhari kpọkuru ndị isiala mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka ka ha jikọọ aka ọnụ mara nke e mere gbasara mpụ, ndị omekataraihepụụjọ nakwa ihe gbasara mgbanwe ihu igwe. Na nzukọ a, ha ekwuteghikwa okwu ịkpọbata mba Moroko n'ogige Ecowas dịka mba ahụ siri chọọ. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Japan a ma dịka Emperor Akihito ekwuola ihe ga-abụ okwu ikpeazụ ọ ga-ekwu ụbọchị ncheta ọmụmụ ya n'ọha tupu ọ rịtuo n'oche n'ọnwa Epreelụ 2019. Nwa Akihito ga-anọchi ya n'afọ 2019 Akihito dị afọ iri asatọ na ise kwuru na ihe kacha emeda ya obi bụ na Japan agaghị agha ọzọ n'ime afọ iri atọ ọ chịchara, etu ha si gaa oge nna ya na-achị. Osinbajo o kwuru na ndị yoruba nwe oche onyeisiala n'afọ 2023? Okwu agbụrụ ga-achi Naijirịa n'afọ 2023 ka na-aga n'etiti ndị ọchịchị na ụmụ Naịjirịa Ọtụtụ ụmụ naịjiria akatọọla okwu na-ewu na soshal midia na Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibajo gwara ndị yoruba na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enye ha oche onyeisiala n'afọ 2023 maọbụrụ na ha tunyere ya na ntuliaka nke 2019. Ihe na-ewu na intanet bụ na o kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta Eze ndị Oyo steeti bụ Alaafin, Oba Lamidi Adeyemi n'ụbọchị Disemba iri abụọ na abụọ nke afọ 2018. Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa kwuru na ha kwetere n'okwu ahụ ebe ụfọdụ na-ekwu na Osote onyeisiala enweghị ike ikwu udiri okwu ahụ. Cheta na ndị dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naijiria bụ Chris Ngige , Odee akwụkwọ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha ,Joe Igbokwe kwuburu na ndị Igbo ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023 maọbụrụ na ha tunyere onyeisiala Buhari na ntuliaka 2019. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a n'elu soshal midia @honeyandsmart kwuru na udiri okwu a ekwesighị ị pụta n'ọnụ onyeisiala makana onye ọbụla nwereike ị bụ onyeisiala n'afọ 2023 ma o merie. @Innocent_Nkire kwuru na otu Pati APC anaghị ekwu eziokwu gbasara agbụrụ ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023. Mana @VillageWizards kwuru na Osote onyeisiala bụ onye na-achọ udo agaghị ekwunwu udiri okwu a. Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naịjirịa akpọrọ NLC n'ichafụ ekwuola na ha ga-eme ngaghariiwe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwari ,2019, iji gosi na obi adịghị ha mma maka etu gọọmenti etiti si adọti imezu mbulite ego opekatampe ndị ọrụ Naịjirịa ruo puku naira iri atọ. Ha chọkwara ka ụlọọrụ na-enyocha mpu na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC nyocha ebubo na-ewere ego ""Paris club reFund"" nakwa ego ndị ọzọ enyere ikwado ndị steeti ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ wee mee ihe ọzọ. N'egwuregwu, Ụkpa ekele ka na-agara onye nchịkota ọhụrụ otu egwuregwu Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer, dịka ụfọdụ na-ekwu na soshal midia na ọbịbia ya mere ka ndị otu egwuregwu Man united gbasie bọọlụ ike. Egwuregwu nke mbu ndị Manchester United gbara n'okpuru Solskjaer mitara ha nnukwu mkpụrụ nke bụ na ha tiri otu Cardiff mmanwụ, site n'inye ha ọkpụ goolu ise asatara otu n'egwuregwu Premiere League ha gbara n'ụbọchị Disemba 22, 2018. N'ofesi, Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ n'alaọmajiji Indonesia ka na-arị Ihe ruru mmadụ iri isii na abụọ Ihe ruru mmadụ otu nari, iri isii na asatọ anwụọla ebe mmadụ nari asaa, iri anọ na asatọ merụrụ ahụ n'alaọmajiji mere n'Obodo Sunda Strait dị na Indonesia dịka ozi ndị ụlọọrụ ọchịchị obodo ahụ si depụta. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nlekọta ebe ihe mberede mere kwuru na ya bụ alaọmajiji mebiri ọtụtụ ebe obibi ndị mmadụ n'obodo ahụ. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ututu: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa World Immigration Day: ""O nweghị ebe yiri ụlọ""" afirika-45518114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45518114,#Ipobsitathome: Egwu ji ndị mmadụ n'ala Igbo,Egwu amaghị ihe taa ga-abụ ji ndị mmadụ bi ọwụwa anyanwu kemgbe ụnyaahụ dịka ndị uweojii na-agaghara n'ihe ha kpọrọ 'igosi ike' nke ha kwuru bụ iji gbaa ndị mmadụ ume na ha dị njikere ichekwa ha.,"Ụnyaahu ọtụtụ ahịa ebe ana ere ngwa nri na-ekwo n'ala Igbo dịka ndị mmadụ na-azụ ihe ha ga-eri taa. Otu onye achọghị ka-akpọ aha ya bi na Nnewi kwuru ""ebe ọtụtụ ndị uweojii na-eme ngagharị nke a butere egwu n'obi ndị mmadụ nakwa ndị chọburu ịpụta iro, ịnọsi ike n'ụlọ"". Onye ọzọ achọkwaghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC n'ekwentị na ""kemgbe ụnyaahụ ndị mmadụ na-azụ nrị ha ga-eri taa iji mee ka ịhe ọbụla ghara ị kpọpụ ha n'ezi taa"". Ndị otu Ipob kpọrọ oku ka Ndigbo nọrọ n'ụlọ n' ụbochi Septemba 14,2018, iji kwanyere ndị e gburu n' 'Egwu Eke' Ndị agha gbara n'ala Igbo afọ. 2017. Ebe ndị uweojii na-ekwu ka ndị mmadụ ghara ige ntị otu ahụ na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra nkịtị n'ihi na ka ga-enye ha nchekwa. Ipob nwetara nkwado otu nwereonwe dị 11, ebe otu dịka Biafra Independet Movement(BIM) akwụnyeghị na nnọrọnụlọ ahụ. Cheta na otu Ipob mere nnọrọnụlọ n'ọnwa May 30 iji cheta ndị nwụrụ n' Agha Biafra. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46082481,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46082481,Labour Strike: Ị dịla njikere?,"Nigeria Labour Congress (NLC) na ndị ọrụ ụgbọala Tanka na ogbo ha na-ahụ maka ụgbọelu ahọrọla ụtụtụ ụbọchị 5, na ha ga-agba abụbọ-ọrụ echi bụ ụbọchị 6 n'ọnwa Nọvemba a.","Ha kwuru na ha ga-ebido abụbọ-ọrụ a ma ọ bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ihe ha na-ana ha. Gịnị ka ha chọrọ? NLC sị ka gọọmentị buliere ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruo N30,000, ebe gọmenti na-asị na ha ga-akwụ naanị N24,500. Peter Ozo-Eson bụ odeakwụkwọ ukwu ndị NLC sị na onweghịzị ihe ọzọ ndị otu ha ga-ekwu banyere nke a, ọ gwụchaa ma a kpọrọ ha bịa tinye aka n'akwụkwọ maka inye ha ihe ha na-ana. Ebe a ka ọ gbajuru dọrọ ugbua. Ọtụtụ ndị ji ego amalitela igo nri na mmiri na-ebusa n'ụlọ ha iji kee nkwụcha maka ya bụ abụbọ-ọrụ na-abịa. Kedụ ka ya bụ abụbọ-ọrụ ga-esi metụta gị? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44759393,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44759393,Akụkọ kachasị n'abalị a: Nwaagbọghọ nwụrụ n'ụlọ enyi ya nwoke,ideremmiri gburu mmadụ na Nsukka,"Ideremmiri na akpa ike na obodo dị ịche ịche ugbua Akụkọ na-eru BBC ntị na-akọ na ideremmiri egbuola ihe dị ka mmadụ atọ na Nsukka, Enugwu steeti Mmadụ atọ ahụ nke gụnyere nwatakiri gbara afọ 5 si ụlọakwụkwọ alọta ka ya bụ oke idere mmiri chichapụrụ ụkwụ n'ala ma bụrụ ya na-aga tupu ahụ ya bu ga ụlọ ọgwụ dịka nta akụkọ siri buo. Azọpụtala mmadụ anọ n'ime mmadụ iri na abụọ idemmiri ribidoro na ọgba Taịland Azọpụtala ụmụaka anọ n'ime ụmụaka 12 tọrọ n'ime ọgba Taịland kemgbe izuụka abụọ. Na aka ọzọ, nne na nna ụmụrụ ụmụ 9 n'ime 12 bụ ndị tọrọ atọ n'ime ọgba Taịland ka ga-achị obi ha n'aka otu abalị ọzọ. ebe akpọpụtalara mmadụ anọ n'ime ụmụaka ahụ. A na-elete mmadụ anọ ndị ahụ anya n'ụlọọgwụ ka ọ dị ụgbụa. Nwaokorobia ahụrụ ozu enyi ya nwanyi n'okpuru akwa Adenike Khadijat Oluboyo na-agụbu akwụkwọ na Adekunle Ajasin University bụ ebe o kwesiri ịpụta n'afọ ọzọ. Ndị ụweojii agbala ama ka otu nwaagbọghọ bụ nwa osote gọọvanọ ondo steeti chibugoro ka ahụru ozu ya n'okpuru akwa enyị ya nwoke. Adenike Khadijat Oluboyo bụ onye a na-achọ achọ kemgbe abalị 6 ka atụrụ anya na ọ ga agụcha akwụkwọ ya na afọ ọzọ gara ihu enyi ya nwoke akpọrọ Adeyemi Alao. N'egwuruegwu Iko mbaụwa Fernando Hierro etinyele akwụkwọ arụkwaghị na Spen Fernando Hierro gbabụrụ Spen, Real Madrid, Bolton Wanderers na ndị ọzo tupu oduru Spen gawa iko mbaụwa bụ ebe ọrụ ya nọ kụọ Kochi ndị Spen bụ Fernando Hierro achiliela aka ka achụpụchara ha n'Iko Mbaụwa. Rọshịa ji penariti gbapụ spen na ịzuụka gaara aga. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise ọmere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee" afirika-57076195,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57076195,"Ọgba mbọ: Nwamadị ji atịtị akwa nka, lee ka o si eme ya",Ifedilichukwu Chibuike bụ nwantorobịa ji atiti na ngwongwo niile dị icheiche ọ na-atụụta n'ikpo ahịahịa akwa nka.,Aka ọrụ ya malitere na nwata mgbe nne ya na-edunye ya ozi itufu ereere Bekee kpọrọ 'plastic'. Ọ si na ọ bụ mgbe ahụ ka o ji banyewa ya n'obi iji erere kwaa nka. Lee ya ka ị hụ ka o si eme ya. Ọrụ a si n'aka Nnamdi Agbanelo na Ikechukwu Kalu 43651608,https://www.bbc.com/igbo/43651608,Ndị uweoji na-achọ nwoke gburu nwa ya n'Enugwu,Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha na-achọ otu nwoke enyere aha ya dịka Onyenwe Offor Ajah echere na o gburu nwa ya nwoke maka esemokwu ezinaụlọ.,"Onye na-ekwuchite ọnụ ndịuweojii n'Enugwu Ebere Amaraizu kwuru ụnyaahụ na nke a mere n'Ameke Enu dị n'agba Aninri n'Enugwu steeti. Enyele aha nwoke e gburu ka Kenneth Ajah dị afọ 38, onye ya na nna ya na-aba mba tupu o were ihe kụọ ya n'isi Kenneth dara n'ala mgbe nna ya mere nke a, e we buru ya gaba ụlọọgwụ. Ọ nwụrụ mgbe otu onye dọkịta n'ụlọọgwụ ahụ mechara ya nyocha. E burula ozu ya gaba ụlọ nchekwa ozu ebe ndịuweoji jisike achọ Onyenwe ma na-ekwe nkwa na ha ga-anwụchi ya ma kpe ya ikpe. Akụkọ ga-amasị gị:" 42828771,https://www.bbc.com/igbo/42828771,Donald Trump na-enye ndị isiala Afrịka nnụkwụ ekene na Davos,Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump si Paul Kagame onyeisiala Rwanda nakwa onyeisioche otu na ahụ maka mba Afrịka niile bụ African Union ka ọ zigara ndị isi Afrịka ndi ọzọ ụkpa ekene.,"Trump na Kagame nwere mkpakorịta na Davos Trump kwuru ihe a mgbe ya na Kagame nwere mkpakọrịta na Davos. Cheta na Trump kpọrọ mba di ichiche na Afrika ""ọnụnụ nsị"". Trump ekwuola na ya ekwughi okwu a a si na o kwuru. Mgbe Trump na Kagame biara ịlụ na ịlụ, Trump emeghị ka ụkwụ esighị ya ike maka ihe ahụ mere. Ọ si na mkpakọrịta ya na kagame nwere gara ọfụma, we kpọ mba ha abụọ ndi na azụkorita ahia bụ ezigbo ọghị. Trump kwukwara: ""A sim kam kene gị, onyeisiala, otu i siri bụ onyeisioche ndị African Union ọhụ... Amam na i na aga nzụkọ nke mbụ gi na mgbe adighị anya. Kene ndị otu gi."" Kagame na onweya si na ha kpara maka mmekọ mba ha abụọ, ma nkwadọ Amerịka na enye Rwanda na uwa niile. Ọ si na ha kwukwara maka ndị Amerịka na aga ezumike na Rwanda." media-45911056,https://www.bbc.com/igbo/media-45911056,Nkechi Blessing Sunday: 'Otele ukwu m na-ekopu ụwa',Nkechi Blessing Sunday bụ onye Igbo ime ejije ndị Yoruba na-amasị.,"Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụghị nnukwu otele ya na-enye ya ọrụ, kama ọ bụ makana ọ na-emete ihe ọbụla a sị ya mee dịka onye na-eme ejije. O kwukwara na anaghị agba ya ndina tupu o soro mee ejije. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48156338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48156338,Muhammadu Buhari: Onyeisiala efebatala Naịjirịa,Ọ bụ n'akara soshal midia Lauretta Onochie bụ onye enyemaka onyeisiala ka akụkọ a siri pụta,"Ihe onyonyo gosiri ebe Buhari si n'ime ụgbọelu aripụta dịka n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja taa. End of Twitter post, 1 Ụfọdụ mmadụ si ya nọọ na njem ya dịka Umaru Sueleiman. E be ndị dịka Moun Erah na-ajụ Onochie ma ọ bụ ọrụ ka o nwere ihe ọzọ onyeisiala gara ime na mba ofesi. Keleccie na-ajụkwa etu njem imeụlọ si ghọrọ njem ọrụ." media-49786476,https://www.bbc.com/igbo/media-49786476,Waste to Wealth: Etu m si hapụ ọrụ ụlọakụ wee tụtụwa plastiki,Ọrụ ụlọakụ so n'ọrụ kacha enye ego n'ụwa niile nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji achọ ya.,"Mana Idu Okwuosa, onye si mba ofesi lọta Naịjiria, hapụrụ ọrụ ya n'ụlọakụ wee malite ịtụtụ plastiki ndị mmadụ tufuru n'okporo ụzọ. Okwuosa kọwaara BBC Igbo etu o si ewere plastiki ndị a nyefee n'aka ndị ga-eji ya arụpụta ihe ọzọ. O jikwa ya enye ọtụtụ ndị mmadụ ọrụ ha ji akpata ego ha ji egbo mkpa. Ọrụ Okwuosa na ndị ọrụ ya na-enyekwa aka igbochi mkpamkpa idemmiri na-akpa n'obodo site n'iwepu ihe ndị na-anọchisi ọwa mmiri. Akụkọ ndị ọọ ga-amasị gị:" 42879970,https://www.bbc.com/igbo/42879970,Mba Saudi Arabia eritela dọlla nde narị na agha mpụ ego,Mba Saudi Arabia na-ekwu na ha enwetala ihe karịrị dọlla otu nde narị site na ibụ agha ha na bụkwasa mpụ na nruru aka ego.,Saudi Arabia bụ otu n'ịme mba ndị alakọọba nwere mmanụ agbịdị n'uju Agha a butekwara itunye mmadụ iri ise na isii n'ime mmadụ nari atọ ejidere n'ime ụlọ nkpọrọ. mmadụ iri ise ndị a si na ezi na ụlọ ndịeze. Onye okaiwu kachasị n'ala Saudi Arabia a na-akpọ Sheikh Saud al-Mojeb sị na nyochapụta nke a were ha ọnwa atọ. Ka akụkọ a na-apụta a ka a na-agba mbọ ka amara maọbụ nke ezie. afirika-52100231,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52100231,"Covid 19 n'otu nkeji: Yabas, jinja maọbụ galik o nwereike inye aka ịgwọta coronavirus?","Kedụ ihe ikwesiri ịma maka ịta jinja, galik maọbụ yabas?","Ndị mmadụ ga-asị taa jinja, galik maọbụ yabas ka o nwereike inye aka ịgwọta Coronavirus, mana gịnị ka ndị WHO kwuru maks nke a? Ihe onyoonyo a ga-akọwara gị ha niile, kirie ya." media-53730202,https://www.bbc.com/igbo/media-53730202,"Angela Nwosu: ""Ihe mmadụ na-echere ndị ọzọ bụ ihe na-abịakute onye ahụ""",Onye ama ama na soshal bụ Angela Nwosu ekwuola na ụfọdụ ndị ihe na-esiri ike bụ maka na ha na-enwe obi ọjọọ mgbe ha hụrụ onye ihe ọma na-emere.,"Nwosu kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a. Ọ kọwara na-etu ihe ọma si abịara mmadụ bụ mgbe mmadụ na-enwe obi ọma maka ihe ọma meere ndị ọzọ, ma rịọọ ka Chukwu gozie ha. Gere ndụmọdụ ya n'uju n'ihe onyonyoo dị n'elu. N'igosi ihe onyoonyo a, abụghị na BBC kwenyere n'okwukwe ya maọbụ ahịa ọ na-ere. Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo so ndị mere ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-50896586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50896586,Christmas Day: Obodo bụ igwe abụghị na a gaghị agba Ekeresimesi - Bishop Onaga,Bishọp ụka katọliki n'Enugwu bụ Callistus Onaga agwala ụmụ Naịjirịa ka ha gosi agbataobi ha ihunanya ma bie ndụ dika ndị otu Kraịst n'oge emume ekeresimesi a.,Bishọp Callistus Onaga bụ Bishọp na-achịkọta Enugwu Achịbishọp Onaga kwupụtara nke a n'Enugwu oge ọ na-ezi ozi Ekeresimesi nke afọ 2019. Onaga jikwa otu aka ahụ kwuo na ihe ndị mba Amerịka kwuru na a na-emegbu ụfọdụ okpukperechi karịa ibe ha na Naịjirịa bụ eziokwu. Onaga gbarụrụ ihu ma nye gọọmenti etiti ndụmọdụ ka o were ire ya gụọ eze ya ọnụ wee chekwaa ndụ na akụnaụba ụmụ Naịjirịa karịa isi na mba Amerịka ekwuteghi ya. O kpere ekpere ka afọ dị mma 2020 karịa nke 2019. Akụkọ ga-amasị gị Ndụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ afirika-47846810,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47846810,Zamfara Killings: Buhari amachiela ngwuputa olaedo na steeti ahụ,Ọ bụ site n'akara Twitter nke Bashir Ahmad bụ onye enyemeka pụrụiche n'ihe gbasara mgbasa ozi ka ozi a pụtara.,"Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na ọ bụ olaedo na-esere ndị mmadụ na Zamfara ha ji emefu ndụ ha. N'ime otu ozi ahụ onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị mbịarambịara niile na-arụ ọrụ na mpaghara ahụ ha pụọ. O kwuru na ndị ọrụ nchekwa pụrụiche nke a kpọrọ ""Puff Adder"" ga-anọchị ebe ahụ niile maka nchekwa." 42696305,https://www.bbc.com/igbo/42696305,Benue a kagbuola ịjị otu afọ efe Naịjirịa a na-kpo NYSC,Otu Gọọmenti etiti guzobere na achikaọta ịjị otu afọ efe ala nna akagbuola agbata nke bụ n'ihi nsogbu a na-ada na ya bụ obodo Benue.,"Ndị mmadụ na ekwu na ha chọrọ ka akwụsị NYSC na ebe nsogbu dị Ha kwuru na ụbọchị ọhụrụ a ga-eji mee mmemme bụ nke ha ga-ekwupụta ma ekwekorita na ya. Gọọmenti etịtị gwakwara ndị niile nke a metụtara ka ha nwee ndidi chere obere oge ka a hazie otu ha ga-esi nweta ya bụ ọzụzụ na enweghi nsogbu ọbụla. Cheta na ndị ọchụ ehi na ndị ọkọ ugbo na-enwe nghọtaghịonwe na Benue, nke butere igbu mmadụ na imebisi ihe ndị mmadụ na steetị ahụ. Anyị ga-ewetakwuru ụnụ akụkọ maka ihe a mgbe anyị nwetela ya." afirika-43287451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43287451,N'Enugwu: Gwongworo adachiela ụzọ Onyeama,Ihe mberede okporoụzọ ahụ mere Ụnyaahụ oge gwongworo bu mmanya sitere n'ọdụ mmanya dị na 9th Mile na nke ka na-aga 9th Mile Kilo tara isi ọnụ wee kurisia mmanya kariri otu puku 'crate' na okporo korota.,"Gwongworo abụọ kụkọtara isi n' Ụzọ Onyeama n' Enugwu. Kemgbe ọdachi a mere, ndị na-eme njem nọzi na nsogbu n'ihi na ọ bụ nanị otu okporoụzọ ka ha na-agbazi. Ndị akaebe nọ mgbe ya bụ ọdachi mere kwuru na onweghị onye nwụrụ anwụ, nanị mmerụahụ ka onye ọkwọụgbọala na onye ọrụ ya merụrụ. Ndị ụgbọala kwara arịrị na kemgbe ọdachi ahụ mere na ha na-atazi nnukwu ajụjụ iji rue ebe ha na-aga. Mgbe onye ntaakụkọ anyị no n'ebe ihe a mere ụnyahụ, ndị nwe ya bụ ụgbọala nakwa mmanya dị n'ime ya na-arụsi ọrụ ike ka ha bupụsịa mmanya ndị dị mma nakwa ndi kụwara akụwa n'ụzọ, ebe ndị ọrụ 'Road Safety' nọkwa na-elekọta gburugburu ahụ ihe mberede mere. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" akuko-ndi-ozo-43006672,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-43006672,Ndị agha e bugala 'Operation Cat race' n'ugwu Hausa,Ọbụzighị ihe ọhụrụ na ndị agha Naijiria na-eji emume ngosi di iche iche eyi ndị arụrụana egwu n'ala Naijirịa.,"Ndị agha Naijịrịa na-eme karị emume ngosi ike ma ọbụrụ na okwu ndị aruala Ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụkwa kedu ihe emume putara ma ihe mere eji nwere aha anụmanị n'eyi egwu mara ha. Onye agha Naijirịa lagoro ezumike nka akpọrọ Abdusalami Ganiyu gwara BBC na-eweputere ya bụ emume ngosi ike iji we kwado nchekwa ọdịnala. O sị na ihe ndị a ka-eji mara emume ngosi ike ndị agha Naijịrịa akpọrọ 'operation cat race',nke ebidogoro na Benue,Taraba na mpaghara ugwu Hausa di icheiche." afirika-54277523,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54277523,Ebidola nnyocha maka ebubo na onye uweojii gburu onyeisi ya n'Eziorsu Oguta LGA dị n'Imo Steeti,Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Isaac Olutayo Akinmoyede enyela iwu ka ebido nyocha ma chọpụta ihe mere dịka akụkọ na-ekwu na otu onye uweojii gbagburu onyeisi ya n'okpuru ọchịchị Eziorsu Oguta nke dị n'Imo steeti.,"Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe ha nọ n'ọrụ ka ya bụ ihe mere. Ihe anyị maara maka ebubo a Akụkọ si Ugwuta, Imo steeti eru anyị ntị na-ekwu na ndị Eziorsu nọ na mgbagharị ugbua n'ihi na otu onye uweojii nọ na ""checkpoint"" werela egbe ya gbapụ onye uweojii ibe ya isi, ọ nwụnyụọ anya pịị. Mazi Godson Ezike bụ onye Eziorsu gwara BBC na ya bụ mkpa mkpa mere n'ehihie Tọzde, ụbọchị 24 nke ọnwa Sepụtemba. Ọ kọrọ na ya bụ ihe sotere nghọtahie malitere oge uweojii kwụsịrị nwaafọ Eziorsu bụ Onyeka Ukachukwu na mgbochi ụzọ ha Bekee na-akpọ ""checkpoint"" were malite ịmaja ya sị na ọ ga-agbagbu ya. ""Ka ndị uweojii na-amaja ya, nwaokorobia ahụ gara zoo n'akụkụ ụgbọala ndị uweojii dị ebe ahụ. Ka onye uweojii ahụ chọrọ ịgba ebe, ọ bụzị onyeisi ya nọ ebe ahụ ka ọ gbara egbe."" Ọ sị na onye uweojii ahụ mere ka ọ gbaa ọsọ mana nwaokorobịa ahụ ọ na-atụ egbe gbatara ọsọ jide ya. ""Ndị uweojii mechara bịa Eziorsu ime nnyocha maka ihe a mere. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii abịala buru ozu onye uweojii a gbagburu ma kpụrụkwa onye uweojii gbagburu mmadụ nakwa ụmụnne abụọ ahụ Onyeka na Ugonna Ukachukwu ya na ha nwere nsogbu ahụ."" Ugbua, Maazị Ezike sị na nwanne nwaokorobia ahụ bụ Ugochukwu Ukachukwu na-arịọ ndị uweojii ka ha hapụ ya n'ihi na ọ bụghị ndị ""bunkering"" ha na-achọ. Eziorsu:'Ndụ anyị nọ n'ụjọ ugbua maka ogbunigwe ndị ka fọrọ n'ala anyị' Nkọwa ya bụ na Onyeka Ukachukwu ahụ ya na onye uweojii a nwere nsogbu tupu ọ gbaa egbe, bụ onye agha elu Naịjirịa. Ọ sịkwa na onye uweojii ahụ e gburu bụ onye mpaghara Egbema dịkwa na steeti ahụ. Ezike na-arụtụ aka na okporo mmanụ agbịdị si be ha gafee so ebute ụdịrị nsogbu a." afirika-43320924,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43320924,Mkparịtaụka anyị nwere maka Osu n'omenaala ndị Igbo,"N'ụbọchị Maachị 8, Chris Kehinde Nwandu na Yvonne Chichi Anoruo bịara n'ụlọọrụ anyị ebe ha nwere mkparitaụka na Facebook Live gbasara Osu n'ala Igbo.","Osu a ga-akwụsị n'ala Igbo? Ndị so anyị na peeji ahụ nwekwara ohere ịju ha ajụjụ ọbụla ha chọrọ. Kirie ya n'uju ebe a. Content is not available End of Facebook post, 1 Akụkọ ga-amasị gị Sineti akụpụla alo imegharị iwu NYSC A tụọla Charles Okah nga mkpụrụ ọka Gọọmentị etiti ana-akpachị mgbasaozi?" 52189453,https://www.bbc.com/igbo/52189453,Victoria Inyama: Ụmụ nwoke Igbo ka elekọta nwunye karịa obodo ndị ọzọ na Naịjirịa,Victoria Inyama bubu onye na-eme ihe onyoonyo na Nollywood mbụ.,Ọ na-agwa BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka di ya na-eti ya ihe n'ala Amerịka. O kwuru etu o siri meri ọrịa kansa. Lee mkparịtaụka anyị na ya na Facebook: afirika-49849108,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49849108,Omoyele Sowore: Ezekwesili agwala gọọmenti ka ha hapụ ya ọsọ ọso,"Dịka ụmụ Naịjirịa bu ngagharịiwe gaa n'ụlkọọrụ 'Human Right Commission', nwaada Igbo bụ Obiageli Ezekwesili esorola kpọkuo gọọmenti etiti ka ha were ọsọ were ije tọhapụ Omoyele Sowore bụ onye ụlọikpe nyegoro ikike ka a tọhapụ kamgbe Tuzde.","Hapụ Sowore ugbụa maọbụ... Oby Ezekwesili Ezekwesili bụ onye kwuru nke a n'akara Twitter taa bụ Frịade sị onye aṅakwala gọọmenti ntị maka ihe ọbụla ha ga-asị na ọ bụ ya gbochiri ha ime ihe ụlọikpe nyere n'iwu ma taa gachaa. End of Twitter post, 1 Ezekwesili sị na gọọmentị Naịjirịa achọghị mgbagha n'ụdi ọbụla ma kwukwaa na ha na-elutu iwu obodo a anya nke bụ na ha anaghị agbanye otu ya bụ iwu Naịjirịa siri kee ọrụ. Ntuliaka oche gọvanọ na Bayelsa Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjiria bụ 'Independent National Electoral Commission' ewepụtala ozi otu a ga-esi mee ntuliaka maka oche gọvanọ na steeti Bayelsa nakwa Kogi. Ntuliaka na steeti abụọ a ga-adị n'ọnwa Nọvemba afọ a. Otu ndọrọndọrọ 45 ga-eso sọọ mpi ịmata onye ga-ewepụta gọvanọ na Bayelsa. Na Kogi, otu ndọrọndọrọ 23 ga-achịpụ ya. Olile anya maka ọdọụgbọelụ Anambra steeti Ndị Anambra steeti nọ n'ọṅụ mgbe ha nụrụ na Gọvanọ Obiano tinyere ijeri Naịra isii maka iji rụọ ọdọụgbọelu nke ga-aba ụgbọelụ ofesi na steeti ahụ. Dịka atụmatụ Obiano si dị, a tụru anya na ọdọụgbọelụ ahụ ga-adị n'Umueri nke didebere Awka. Ọ gụpụtara ya bụ bọjet n'ụlọomeiwu steeti ahụ ụnyahụ bụ Tọzde 2019. Iran atọhapụla ụgbọmmiri bụ ọkọlọtọ mba Briten Mba Iran atọhapụla ụgbọmmiri bu ọkọlọtọ ndị Briten ha ji kemgbe ọnwa abụọ gara aga. Cheta na ejidere Stena Bulk izu abụọ ka Royal Marine jidechere ụgbọmmiri ndị Iran na akụkụ Gibraltar. Iran ka na-ekwusi ike na ọ bụghị ọbọ ka bọrọ. 'IAAF World Athletic Championship' ebirila ọkụ Ndị na-agba ọsọ n'asọmpi IAAF Asọmpị World Athelic Championship amalite taa bụ Fraịde na Doha, isi obodo Kataa. Ndị na-ahazi asọmpị a bụ otu 'International Association of Athletics Federations' (IAAF). Ka o si gbata kwụrụ ugbua, Christain Coleman, Justin Gatlin, Zharnel Hughes na Adam Gemili eruola agba nke osote nke ikpeazụ n'ọsọ nke ụmụnwoke nke mita narị. Gee akụkọ ndị a niile na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị oweojii atọhapụla ndị a n'agbụ Ndị uweojii nke mpaghara ugwu nke Naijirịa enyochapụtala ụlọ mkpagbu na ntaramahụhụ ndị mmadụ ruru 500 dị na mpaghara Rigasa nke Kaduna steeti. Onyeisi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Ali Janga gwara BBC na ọ bụ onye ọgba ama gwara ha maka ụlọ mkpagbu a. Ọ kwuru na ọ bụ ụbochi tụzde ka ndị uweojii wuchiri ebe ahu. Janga kwuru na ha hụrụ ihe ruru ụmụnwoke nari ise nke ọtụtu n'ime ha bụ ụmụaka nọ n'ime ụlọ ahụ. Ụfọdu n'ime ndị ahụrụ n'ụlọ ahụ bu ịgịga n'ụkwụ ebe ụfọdu bụ ndị awakporo n'ike. Maazị Janga kwuru na ha amatachabeghi etu ụmụ nwoke ndị ahụ siri rute n'ụlọ ahụ kama ụfọdụ si na ọ bụ nne na nna ha kpọtara ebe ahụ maka ọmụmụ ofufe Alakuba. Ndị uweojii na-ekwu na onweghi ihe gosiri na-ebe ahụ bụ ụlọakwụkwọ. Dịka ọdị ugbua, akpọpụla ụmụ nwoke ndị a. Ụfodụ n'ime ha bu apa na ọnya. Ụfọdụ ndị atụghapụrụ bu ịga n'aka nakwa ụkwụ Aka ndị uweojii akparala mmadụ asatọ gbasara mkpamkpa a. Ndị uweoji sị na ha ka na-eme nyocha, ma kwukwa na ha mecha ha ga-akpọpụ ndị mere ihe a ụloikpe. Ebe ọzọ na mpaghara ugwu Ndị agha ahụ si Damaturu na-aga Maiduguri mgbe ha zutere ọnwụ ha Ogbunigwe adọrọ n'okporoụzọ egbuola mmadụ isii n'obodo Kamuya dị na Borno steeti mgbe ha na-eme njem. A na-eche na ọ bụ otu ndị na-eyi ndụ egwu na mpaghara ahụ kpọrọ onwe ha ISWAP kpara mkpa mkpa a. Mugabe enwetala ebe ezumike ya Akpatị ozu Mugabe ebe ndị mmadụ nwereike ịga we nye ya ugwu ikpeazụ Ezinaụlọ aka chiburu mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe emeriela ndọrọndọrọ maka ebe a ga-eli ya. Cheta na gọọmentị mba ahụ chọrọ ka elie ya ebe a na-eli ndị dike mba ahụ ebe ezinaụlọ ya chọrọ ka elie ya ebe eliri ndị nna nna ya. N'egwuregwu, Otu Slavia Prague nke Czech Republic ezigarala onye ọgba bọọlụ ha bụ Peter Olayinka ozi ekele dịka Gernot Rohr họpụtara ya na ndị ga-eso gbara Naịjirịa bọọlụ n'asọmpị enyi na enyi ha na mba Brazil na-akwado ịgba. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45218129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45218129,Eid-El-Kabir: Gọọmenti abalị abụọ dịka ụbọchị ezumike,Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime ala anyị bụ Abdulrahman Dambazau kwupụtara nke a ụbọchị Tọsde n'Abuja n'akwụkwọ si n'ụlọọrụ ya n'aha gọọmentị etiti.,Eide-El-Kabir bụ emume sọ na ndị dịkachara mkpa na ndụ ndị na-ekpe ụka Alakụba na-eme. Emume nke ha na-egbukarị ebule bụ emume ha ji echeta nrubeisi Ibrahim(Abraham) rubere site n'ikwenye iji nwa ya chụọrọ Chineke aja. Dambazau rịọrọ ụmụ Naijiria ka ha were ohere a makụọ ifunanya na ịchụ aja maka ịdịnotu na ọganihu Naijiria. Ọ rịọkwara ndị Naijiria nọ n'ụlọ na ndị bị n'ọhịa ka ha kwado ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. Dambazau kpere mmadụ niile ekpere ihe ọṅụ n'oge emume a. Akụkọ ga-amasị gị afirika-43962478,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962478,Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ,"Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa bụ, Emzor Pharmaceuticals,achụọla otu onyeọrụ , ma kwụsịkwa abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara codeine, n'ụzọ megidere iwu, dịka akụkọ nchọpụta nke BBC mere nke gosiri ka ọgwụ ụkwara ahụ sị ala ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa n'iyi.","Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye Emzor chụrụ onye otu onye ọree ahịa ha nke resiri onye ntaakụkọ BBC ọgwụ, Emzolyn syrup. Ha kwuru nke a na igwe okwu soshal midia ka BBC wepụtachara ihe onyonyo ha mere n' ụbọchị Monde abali 30 nke ọnwa Epreelu. N'ime ihe onyonyo ahụ zuru otu elekere, e gosịrị otu ndị ahịa ọgwụ ndị gụnyere otu onye ọrụ Emzor ji ụzọ azụlọ na-eresi ndị mmadụ ọgwụ ụkwara. Iwe na ọnụma juru ndị bịara nkiri ihe onyonyo ahụ nke egosiri na Legos ụnyaahụ Otu onye kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-etinye mmanụ n'ọkụ a na-agba na Kano dịka o kwuru na ha na-eke ndị ntoroọbịa ọgwụ a dịka ihe onyinye. Mana ụlọọrụ Emzor agọọla na ha anaghị ere ọgwụ n'ụzọ n'ezighi ezi. Ha kwukwara na ha akwụsịla ire Emzolyn nwere Codeine rue mgbe ha ga-emecha nyocha n'ime ebubo na ha na-ere ọgwụ ụkwara ha n'ụzọ akwụghị ọtọ. Emzor kwụsịburu one oreeahịa ha ma meecha chụọ ya n'ọrụ. ""Emzor Pharmaceuticals bụ ụlọọrụ na-akwanyere onwe ya ugwu ma na akwụwa aka ya ọtọ. nke nwere akwụkwọ ikike ire ọgwụ karịrị otu narị na iri abụọ nke gụnyere Emzolyn Codeine n'aka NAFDAC. "" Ha gara n'ihu sị: A kwụsịla nkesa Emzolyn Codeine yue mgbe a ga-emecha nyocha zuru oke.'' Na mkparịtaụka BBC na onyeisi ngalaba n'ahụ maka nhazi ọzụzụ na ọrụ ndị omeeọgwụ (pharmacists) na Naịjirịa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ J.C Okafor nwere. O kwuru sị na e nwere iwu na-echekwa ka esi ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine, ma kwụwa n'ụlọọrụ ọbụla achọpụtara na ha na-ekesa ya n'ụzọ ezighị ezi, a ga-emechi ya. Okafor sị,""Anyị nwere atụmatụ etu e ji ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine na Naijiria nke meere na mmadụ enweghị ike ịzụ ya na-ejighị akwụ onye dọkịta. Ụlọọrụ ọbụla a chọpụtara dara iwu ahụ, anyị na-emechi ya."" Otụtụ ndị Najiria nọ na choal midịa na-ata Emzor ụta maka aka ha ndị na nsogbu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara dị n'etiti ndị na-eto eto. Otu onye jụrụ ụlọọrụ ahụ sị : Ya mere, ọ bụrụ na ụlọọrụ BBC egosighị nchopụta ahụ, ụlọọrụ unu agaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị oke ịṅụ ọgwụ a n'etiti ndị ntoroọbịa? Ọ bụ na ndị ọrụ ụnụ amaghị ihe ha na-eme? Onye ọzọ, Mairo Mandara, kpọrọ oku ka gọọmenti machie orire ọgwụ ụkwara nwere codeine." afirika-44125608,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44125608,Ejighi ọnụ agwa Ndị Igbo na ụzọ dị mma - Ohuabunwa gwara Igbokwe,"Mao Ohuabunwa bu omeiwu ukwu na-anochịte anya ndị Abịa Nọt n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na be ya n'Abuja maka ihe metụtara ndị Igbo, ọkachasị ebe ọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na ha bụ ndị ji ya mere aka ọrụ.","Mao Ohuabunwa kwuru maka Joe Igbokwe Na mbụ, anyị jụrụ Ohuabunwa maka ihe ndị mmadụ na-ekwu na ndị nọ na ndọrọndọrọ bụ ndị anya adịghị eru n'ala etu o kwesịrị. Ohuabunwa sị na nke a abụghị eziokwu ọkachasi ebe ọ metụtara ya. O kwuru na o bidoro ndọrọndọrọ mgbe ndịagha chiliri aka elu were nye ndị nkịtị ọchịchị n'afọ 1999. Mgbe ahụ, o kwuru, ndị ndọrọndọrọ ebidobeghị inwe ihe ndị Bekee na-akpọ ""godfather"". O kwukwara na ndị ndọrọndọrọ si ala Igbo gbara mbọ ọfụma ịhụ na oke ruru ala Igbo lọtara. Mana okwu ya, bụ nke gosiri na Ndị Igbo metere ndọrọndọrọ ọfụma mgbe ahụ, mere ka anyị jụọ ya maka ihe Joe Igbokwe, bụ ọnu na-ekwuchitere ndị All Progressives Congress (APC) bụ pati nọ n'ọchịchị na Legọsị steeti, kwuru banyere etu Igbo si eme ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ sara anyị sị na Igbokwe kwesịrị iweta ihe ọma ọ hụrụ na nkata nke ọ nọ (bụ APC) nye Ndị Igbo. Okwu ya nke a dị n'elu. Anyị jụrụ Ohuabunwa maka ihe onye otu ya bụ Dino Melaye na-agabiga site n'oku ndị uweojii kpọrọ ya, ọ gwara anyị na ihe a na-eme abụghi ihe kwesịrị maka ọ mere mba ndị ọzọ ewere ya na-achị ndị Naịjirịa ọchị. Ọ sị na ọ bụ obodo ka a na-akparị na ọbụghị Dino. Lee ihe o kwuru ebe a: Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa N'ihe banyere ihe ụfọdụ mmadụ ji na-akatọ ya maka nkwalite o mere, ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị anya ụfụ na-eme ihe a, maka ihe o mere bụ inyere ndị mmadụ aka ịhụ na ha nwetara ihe ha ga-eji nyere onwe ha aka. Gee ya nti: Sinetọ Mao Ohuabunwa kọwapụtara ihe kpatara o jiri nye ndị ọ na-anọchite ite eji eghe ihe Na ngwụcha, Omeiwu Ohuabunwa gwakwara BBC Igbo na ha bụ ndị na-anọchịte anya ndi Igbo n'ụlọomeiwu na-agba mgbọ ịhụ na ahaziri ọnọdụ Igbo na Naịjirịa, mana ọ siri na ọ ga-abụ n'usoro ndị Bekee kpọrọ ""restructuring"" ka a ga-eji mee ya bụ nhazigharị. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:" 42900004,https://www.bbc.com/igbo/42900004,Ayade: Gụanụ okporo ụzọ aha Ekwueme,"Ayade rịọrọ gọọmenti etiti ka ọ gụọ nkụkwụ ọkpọro ụzọ maọbụ ewumewu nke gọọmenti aha osote onye isiala mgbe gara aga, bụ Dr Ekwuemme iji cheta nkwado o nyere maka kwalite ọchịchị ala Naijiria.","Dr Alex Ekwueme bụ ọnye ndọrọndọrọ ọchịchị a mara dịka onye nwere ọtụtụ nzere agụmakwụkwọ mahadum Okamụta ahụ rịọrọ aririọ a mgbe o duru osote ya bụ prof Ivara Esu, na ndị otu ọchịche ya ga nkwanye uguwu ikpeazụ nke e mere Ekwueme nwụrụ anwụ na Enugwu. Bishop Chukwuma na dụ ndị biara emume a ọdụ O kwuru na ọ gaghị adi mma ma ọbụrụ na a gụọ ewumegu nke mpaghara Naijiria kama ka agụọ ewumewu nke gọọm̀enti etiti dị n' Abụja. Ayade kọwara na Ekwueme bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nyere aka kwalite oganiru Naijiriaa na mba ojii." 52504580,https://www.bbc.com/igbo/52504580,Workers' Day: Ndịọrụ ahụike na ndị ọzọ na-ekele ụmụ Naịjirịa n'ụbọchị ncheta ndịọrụ,Ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ n'ụwa niile.,"Nke afọ a, ọrịa coronavirus emeela ka ọtụụ ndịọrụ nọrọ n'ụlọ. Naanị ndị ọrụ ahụike na ndị ọrụ ndị ọzọ dị mkpa na-agazi ọrụ n'oge a. Lee ka ụfọdụ ndịọrụ ahụike si ekele ụmụ Igbo taa." afirika-43031901,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43031901,Innoson agbala akwụkwọ ka uweojii ghara ịnwụchi ya,"Onye nwe Innoson Motors, bụ Innocent Chukwuma, agbala akwukwo n'ụlọikpe ukwu dị na Lagos ka a ghara ịnwụchịe ya dị ka ụlọikpe nyere iwu izu gara aga.","Innocent Chukwuma, onye ojiegoachuego a ma ama nwere ikpe n'ụlọikpe dị icheiche gbasara esemokwu ya na GTbank N'ụbọchị Fraide gara aga, Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie nwa amadị ahụ bụ ojiegoachụego n'ihi na ọ biaghị n'ụlọikpe ụbọchị a kara ikpe maka ebubo mpụ na ime akwụkwọ adigboroja eboro ya. Mana n'ụlọikpe mkpegharị nke dị na Lagos, Chukwuma rịọrọ ka edota n'akụkụ iwu ahụ ụlọikpe nke mbụ nyere. Ọkaikpe nọchitere Chukwuma bụ Joseph Mbadugha, gwara ụlọikpe na enyeghị Chukwuma akwụkwọ ịkpọ oku bịa ụlọikpe. Akụkọ a ka na aputa, anyi ga ewetere ụnụ ozi ọzọ banyere ya." afirika-45503805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45503805,EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere,N'okwu gọọmentị na-achị ugbua kwuru na ọkụ latrik ga na-enwu kwa mgbe ma ọ bụrụ na-atụnyere onyeisiala Buhari n'afọ 2019.,BBC Igbo jụrụ onyeisi mgbasa ozi Enugu Electricity Distribution Company bụ Emeka Ezeh ajụjụ gbasara nke a. O kwuru na ọbụghị naanị ihe a na-ekweta na nkwa kama na ọ bụ site n'ịrụ ọrụ so ya n'azụ. Ọ kwuru na ihe gbasara ọkụ latrik ekwesighi ịbụ ihe eji achụnta vootu dịka gọọmentị nakwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji ya eme ugbua. Ezeh gara n'ihu kwuo na gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwerela n'isi ọkụ latrik kamgbe ha bara ọchịchị. Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-46205616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46205616,2019 Elections: Ọ bịbịa Atiku abụghị maka anyị - Ndị ntoroọbịa Igbo,Akụkọ dị mkpa Atiku gara Enugwu,"Ụfọdụ ndị Igbo ekwuwela uche ha gbasara ọgbakọ Atiku na ndị isi ha mere n'Enugwu n'ụbọchị November 14,2018. Onye ndu ndị ntoroọbịa ohaneze ndị Igbo bụ Kingsley Dozie kwuru na Atiku na-akọrọ onwe ya na ndị ọ ma na ọ bụghị ndị ntoroọbịa Igbo ka ọ bịakwutere. O kwukwara na ndị ntoroọbịa Igbo agaghị atụnyere Atiku maka na o bughi ha n'obi. Ụfọdụ ndị isi ala Igbo kpọrọ ọgbakọ ha ""mkpoko Igbo"" ekwetala maka mpụta Atiku Abubakar na Peter Obi dịka ndị ga-azọ oche onyeisiala na ntuliaka 2019. Ha kwukwara na mmekpa ahụ ndị Igbo akarịala ya kpatara na ọ bụ naanị mgbe Atiku/Obi chịwara ka ha nwere olileanya na ọnọdụ a ga-agbanwe. Ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo biara ya bụ ọgbakọ gụnyere Obi nke Onicha bụ Igwe Nnaemeka Achebe, onyeisi ohaneze ndịgbo bụ Nnia Nwodo, sinatọ Enyinnaya Abaribe na ndị ọzọ. Onye gụpụtara nkwekọrịta ha bụ Olisa Agbakọba kwuru na ihe mere ha ji kweta na Atiku na Peter ga-azọ ọkwa onyeisiala bụ maka nhazigharị Naịjirịa ha kwuru ha ga-eme ma ha banye n'ọkwa. Ha kwetara na mpụta Atiku na Obi ga-eme ka ndị Igbo nwee ọnụ n'ihe na-eme n'etiti gọọmenti Naịjirịa. Ọkammụta Nwabueze rịọrịọ ndị Igbo ka ha kwadọ mpụta Atiku na Obi ma tụnyere ha n'igwe ka ha merie na ntuliaka na-abịanụ. O kwuru otu ihe ọ chọrọ ime tupu ọnwụọ bụ ihụ na ndigbo so n'ihe a na-eme na gọọmenti etiti. Nwabueze kwuru na ọ gaghị ezu ike maọbụrụ na ndigbo esonyeghi n'ihe a na-eme na Naịjirịa ma rịọkwa ndị ọchịchị ala Igbo ka ha were otu obi na-eme ihe. Cheta na onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abububar gara Enugwu ebe ya na ndị isi ụfọdụ ndị ndu Igbo nwerr nzukọ. Akụkọ kwuburu na obi adịghi ụfọdụ ndị na-achi Igbo mma maka etu o siri họpụta Peter Obi dịka onye ga-abụrụ ya osote onyeisiala ma o merie ntuliaka 2019. Ụfọdụ gọvanọ na ndị eze ama ama nọ na nzụkọ ahụ. Osita Chidoka, bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu dere maka nzụkọ a n'akara Twitter ya. Akụkọ ka na-abịa Ọzọ, Kanu na-efu kamgbe Sepụtemba afọ 2017 Ụlọikpe ukwu di n'Abuja agwaala Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ gbara Nnamdi Kanu aka ebe ha kwụọ otu nde narị naira. Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji hanye Nnamdi Kanu n'aka Abaribe n'afọ 2017. Na mba ofesi Minista na-ahụ maka nchekwa na mba Izrel bụ Avigdor Lieberman agbaala arụkwaghị m. O mere nke a n'ihi nkwekọrịta ndị gọọmentị etiti mba ahụ nwere iji kwụsị ọgụ n'etiti ha ndị Palestine n'abalị abụọ na Gaza. N'egwuregwu Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa esila Abidjan gaba Accra na njem ịbulata iko mba Afrịka nke ụmụ nwaanyị. Ha kwuputara nke a site n'akara twitter ha. Gee nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ite ime na-arị elu Nchọpụta e mere maka atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 2018 Global Family Planning kwuru na ime e tepụrụla na Naịjirịa n'afọ 2018 eruola otu nde na ọma(1.3m.), ebe ndị tere ime azụụlọ dị 735,000. E wepụtara akụkọ a n'ọgbakọ atụmatụ ezinaụlọ bụ International Conference on Family Planning bụ nke na-eme na mba Rwanda ugbua. INEC Ebonyi Steeti na-arịọ ndị mmadụ arịrịọ Inec: Bia nara PVC gị Dịka ọ fọdụrụ naanị abalị otu narị ka e mee ntuliaka afọ 2019, ụlọọrụ INEC nke Ebonyi Steeti etiela mkpu na ọtụtụ ndị mmadụ a bịabeghi were akwụkwọ ntuliaka ha. Onyeisi ụlọọrụ ahụ na Ebonyi Steeti bụ Godswill Obioma kwuru na ihe karịrị otu puku akwụkwọ ntuliaka ka nọ n'aka ha ugbua. N'ofesi Ndị na-agbanyụ ọkụ na kalifonịa ekwuola na mmadụ iri anọ na asatọ anwụọla ebe ọtụtụ na-efu efu n'ihi ọkụ ọgbụgba a. Ndị ọrụ a kwuru na ha ejikọtala ọkụ na-agba n'obodo ahụ ka ọ ghara ifesasị mana ha agaghị emeli nke ruo otu ọnwa. N'egwuregwu Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọtara na Mexico n'emume mmalite asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị na-enweghi ụlọ nke agba iri na isii ya. Ihe a bụ asọmpị e hiwere n'afọ iri abụọ gara aga, iji kwalite ndụ ndị na onweghi ka ọha bụrụ ha n'ụwa. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Apprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka" afirika-43665487,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43665487,Ụlọomeiwu: Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu,"Ndị omeiwu ndị a ndị kpọrọ oku a ụnyaaahụ bụ Tọsday n'Abụja si ka gọọmenti kwụwa ndị agha na obodo niile dị na Benue steeti ebe ndị Fụlanị na-achị ehị na-awakpo, kama Ọsọ Nwamba nke bụ egwu onye gbacha ọ la.","Ndị obodo dị na mpaghara ebe ndị ọchịehị nọ ebidola ị chekwa onwe ha Ndị omeiwu mmadụ anọ; John Dyeghndị, Dickson Takighir, Mr. Samuel Udende, Mark Terseer-Gbillah, ndị kwuchitere ndị ọzọ mara atụ na bido n'ụbọchị abụọ rue nke anọ ọnwa Eprel, na e gburu mmadụ iri abụọ ọhụrụ n'ebe ahụ, ebe ọtụtụ ka na-efu efu. Ha boro ebubo na onweghị enyemaka ọ bụla si na aka ndị ọrụ nchekwa n'ebe ụfọdụ ọdachịi ndị a mere. Ha were kpokuo gọọmenti etiti ka ọ gụọ ndị ọchịehi, ""ndị oyiegwu"". Ndị omeiwu a gosiri mgbakwojuanya na a kwụsịrị Ọsọ Nwamba nke ndị agha na steeti ahụ ebe ọ na-aga n'ihu na agbataobi ha dịka na Taraba. Na nkọwa otu n'ime ha bụ Takighir, nkwafu ọbara nke mere nsonso a mere na Ikyon na Agasha na abala atọ na abali anọ nke ọnwa Eprel; ndị ọchịehi kpara mkpamkpa na Semaka, Asom na Babanruwa na abali atọ nke ọnwa Eprel ebe ha chetara ndị obodo Udei na Umenger n'a abalị abụọ nke abụọ Eprel. ""Otu a ka o siri mee na mpaghara Sengev, Mbakyondo na Mbapa dị n'okpuru ọchịchị Gwer-West dịka ndị ọchịehi ji ngwa agha na akpa ike ebe ahụ. ""Na Tsegaase,ha gburu mmadụ abụọ, ebe otu onye na-efu na Zwatema, e gburu mmadụ abụọ na Tse Adeke, otu onye na Tse Adudu, ebe otu onye na-efu na Tsekelefu. Ka ọ dị ugbua anyị amatabeghị mmadụ ole ihe metụtara n'Enger. N'abali atọ nke ọnwa Eprel, e gburu mmadụ anọ n'Anyebe, otu onye na Mbavihi nke wardụ Tonbo dị n'okpuru ọchịchị Logo local government."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị omeimu ndị a kwuru na ọdachị ndịa niile mere na agbanyeghị na ndị agha na eme ọsọ Nwamba na steeti ahụ, ma ga n'ihu kwuo na ọ gbara ha gharịị na ndị agha kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' na-agbanyeghị gbuogbuogbuo nka na-eme ebe ahụ. Ha kporo oku na gọọmenti ziga ndị agha na obodo ndị nsogbu a na-emetụta. ""Anyi na-akpọ gọọmenti etiti oku ka ha kọwara ndị Benue na ndịị alal Naijiria ihe mere na a kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' naa Benue ebe ihe na-ebe ka na-ebe. ""Anyị chọrọ ka gọọmenti ziga ndị agha na Benue dịka o kwesịrị ma nwe ebe ndị agha na-anọ na mpaghara ebe ihe ndị a na-eme were rue mgbe nsogbu ga-abịa na njedebe. ""Anyị na-akpọ gọọmenti etiti oku ka o mee ọ gụọ ndị ọchịehị 'ndị oyiegwu ozigbo n'ihi mpụ na imebi ihe ha na-eme. Ndị mba ụwa lee anya ma hụ ka ndị a si acho ikpochapụ ndị Benue.""" 42805192,https://www.bbc.com/igbo/42805192,Lasa Fiva: Anambra Steeti amachiela ịnụ garị,"Dịka otu na-ahụ maka ahụ ike mba uwa bụ WHO n'aha ịchafu siri kwuo, ọrịa lasa fiva na-agasa site na iri ihe maọbụ i metụ ihe mamiri maọbụ nsị oke.","E nwere ike i bute Lasa fiva na garị oke nyụnyere nsị maọbụ mamịrị Gari bụ nri Naijiria a ma ama nke e si n' akpụ emepụta maka oriri maọbụ ọṅụṅụ. Ọ bụrụ na e sie garri ọfụma, nje na-ebute lasa fiva ga-anwụ mana ọtụtụ ndị Naijiria na- aṅụ ya aṅụ. Dr Joe Akabuike, onye bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike n' Anambara Steeti sịrị:""Garị ị na-ahụ ka agbasara ya n'okporo ụzọ mgbe ị na-aga njem dị egwu iri ọkachasị, ịṅịṅụ."" Akabuike gara n'ihu kwue na njem na-ebu ọrịa emerụọla gari dị otu ahụ. Enwela ọtụtụ ndị mmadụ ọria Lasa fiva tụrụ na Naijiria. Ụbọchị ụka gara aga, otu dọkịta nwụrụ n'Edo Steeti ka o butechara ọrịa Lasa fiva n'aka nwa ọhụ bu ya o letara." egwuregwu-44193595,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44193595,Garba Shehu akatọọlụ PDP ọhụrụ,"Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu kwuru na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa kwado otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na ntuliaka 2019, ego niile gọmentị a chọpụtara n'aka ndị zuru ego Naịjirịa ga-alaghachị azụ n'aka ndị zuru ego ahụ.","Garba Shehu Shehu dere ihe a, n'ime akwụkwọ o nyere ndị ntaakụkọ gbasara okwu PDP na-ekwusi ike ugbua akpọrọ 'Change the Change campaign' na bekee. O kwukwara na Naịjirịa ga-alaghachị azụ gawa ebe ha nọrọ tupu afọ 2015, na kwa megharị ihe ọma niile otu APC butere na Naịjirịa. Shehu dọrọ Naịjirịa aka na nti, ka ha cheta na ọ bụ mpu na aghọghọ mere ka APC merie PDP na ntụlịaka afọ 2015. N'ọnụ okwu ya, ''APC bụ sọọsọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebuso mpu na aghọghọ agha na Naịjirịa.'' Shehu dekwara na ọ bụ ezie na ọ bụ gọọmentị PDP mụpụtara EFCC, mana onweghị ihe ọbụla EFCC mere ruo oge ọchịchị APC. Mana ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan kwuru na ha na-elebe anya n'okwu a Garba Shehu kwuru, ma na-akwado ịzaghachị ya okwu a. Akụkọ ga-amasị gị:" 43525624,https://www.bbc.com/igbo/43525624,Ndị Igbo na-ekwu na Igbo agaghị enweta ọchịchị Naịjirịa na 2019,"Ka a na-akwadọ ntuli aka nke 2019, ụmụ Igbo na-etinye ọnụ n'okwu banyere ya bụ emume.","Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwusiri ike na Igbo agaghị achịta aja na 2019, ọkachasị ma ọ bụrụ na ọ bụ oche onyeisiala ka ha na-achọ. Lee ihe ha kwuru ebe a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54327121,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54327121,Bitcoin to dollar: Ego ole ka otu bitcoin na-ada na naịra ugbua?,Ikenna Ogbaraegbe bụ otu onye na-azụ ma na-ere ego igwe a kpọrọ bitcoin akọwaala ego ole ọ na-ada ma a tụnyere ya na naịra nakwa dọla.,"Nke a na-abịa dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla Ogbaraegbe sị na ego ole bitcoin na-ada kwa ụbọchị dabere n'egole dọla na-ada kwa ụbọchị ma a tụnyere ya naịra. Ọ sị n'iji maa atụ dịka taa ụbọchị 9 Febụwarị afọ 2021, na otu bitcoin (1btn) bụ ihe dịka puku dọla iri anọ na isii ($46,720). Ebe otu dọla ($1) bụ narị naịra anọ na iri itoolu (N490), ọ bụrụ na ị gbakọọ ya ($46,720 X N490) ọ ga-apụta (N22,892,800). Nke a pụtara na otu bitcoin bụ nde iri abụọ na abụọ na ụma (1 btn = N22,892,800) dịka ọ dị n'ụbọchị 9, Febụwarị 2021. Mana Ogbaraegbe sị na ọnụego bitcoin na-agbago ma na-arịtukwa na ọ naghị anọkaarị otu ebe. Ka m si eji Cryptocurrency enweta mbadamba ego E nwekwara 'cryptocurrency' dị icheiche ma e wepụ Bitcoin. Ha gụnyere Ethereum, Litecoin, Ripple na ndị ọzọ Dịka ụlọakụ etiti machiri ụlọakụ dị icheiche na Naijirịa itinye aka na Crypto currency n'ụzọ ọbụla, ụfọdụ ndị ji ya bụ Cryptocurrency akpa ego na-eti mkpụ na ya bụ mmachi bụ ezigbo ọdachi na-ebe ha nọ. Kama ụfọdụ na-asị na ọ bụ aghọtaghị mere ndị mmadụ ji atụ egwu. Ndị ntoroọbịa na Naijirịa ekwuola etu ya bụ mmachi siri metụta ha. Onweghị gọọmentị nwere ike ịmachi cryptocurrency - Augustine Arachie Augustine Arachie bụ onye nkuzi na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambra steeti, ma na-azụkwa ahịa Cryptocurrency. Ọ kọwara na gọọmentị agaghị amachinwu bitcoin maọbụ cryptocurrency ndị ọzọ, kama ha emeela ka ọ siere ndị mmadụ ike iji ya azụ ahịa. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ihe o kwuru : Ndị mmadụ aghọtaghị ihe goọmentị mere maka Cryptocurrency. Ụlọọrụ Central Bank of Nigeria akọwaala ihe mere ha ji machie ụlọakụ niile dị na Naịjirịa iji cryptocurrency mee ihe ọbụla. N'akwụkwọ Osita Nwanisiobi bụ ọnụ na-ekwuchitere CBN , ụlọọrụ CBN kwuru na ha machibuola ụlọakụ niile nọ Naịjirịa iji cryptocurrency kamgbe afọ 2017. CBN kpọpụtara mba dịka China, Canada, Taiwan, Indonesia, Algeria, Egypt, Morocco, Bolivia, Kyrgyzstan, Ecuador, Saudi Arabia, Jordan, Iran, Bangladesh, Nepal na Cambodia amachiela iji cryptocurrency zụọ ahịa makana e nwerike iji ya nye ndị oyi egwu ego, zụọ ego nakwa mee ihe ọjọ ndị ọzọ. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ebe ọ bụ na ọ bụ ndị na-enweghị ikike na-enye ya bụ'cryptocurrencies' mere ka ọ ghara ịdaba n'usoro CBN si eme ihe dịka ha depụtara na CBN act (2007) ka ngalaba na-enye ego na Naịjirịa. CBN kwuru ọ ka na-agbagoju ha anya etu ndị nwe cryptocurrency si ezo ihu nke mere ka ndị mmadụ na-aju ihe mere ha ji ezo ihu ha maọbụrụ na ha ma na iwu kwadoro ihe ha na-eme. Ha kwuru na mmachị a agaghị emebi ihe ọbụla gbasara iji ego kwụ ụgwọ na intanet maọbụ nwulite FinTech. Cryptocurrency: Mmachi cryptocurrency ga-eme ka ụbịam karịa na Naịjirịa - Atiku Osote Onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Abubakar Atiku etinyekwala ọnụ n'ịkatọ mmachi gọọmentị machiri cryptocurrency na Naịjirịa. Atiku kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ehihie Satọde. O kwuru na ugbua abụghị oge gọọmentị kwesịrị itinye atụtamụ dị otu a nke nwere ike ime ka ụbịam kawanye njọ. Atiku kwuru na ụzọ ka mma iji soo ihe gbasara 'cryptocurrency' bụ ịchọ ụzọ gọọmentị ga-esi na-ahazi ya, ọbụghị ịkwụsị ya kpamkpam. Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua abụghị oge gọọmentị ga-etinye atụmatụ ga-eme ka ego kwụsị ịbata na Naịjirịa. Oby Ezekwesili, ndị ọzọ akatọọla mmachi cryptocurrency Ụfọdụ naị ama ama akatọọla mkpebi gọọmentị etiti ịmachi bitcoin na cryptocurrency ndị ọzọ. Otu n'ime ha bụ Oby Ezekwesili onye bụbu mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa Oby Ezekwesili: 'M ga-agba mgba dị na ndọrọndọrọ 2019' Ezekwesili rụkwara ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank', ma sorokwa zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019. N'ozi o zipụrụ n'akara Twitter ya, Ezekwesịlị kwuwu na gọọmentị gaara ịgba mbọ ịmụta etu cryptocurrency si arụ ọrụ kama ịmachi ya. Onye ọzọ kwuru okwu maka ya bụ Japhet Omojuwa, onye ode akwụkwọ nakwa onye nwere agba na soshal midịa. Omojuwa kwuru na mbọ niile gọọmentị sị na ha na-agba iji wulite akụnụba Naịjirịa akụọla afọ n'ala n'ihi mmachi a. Mana Boason Omofaye, onye ntaakụkọ bụ ọkachamara maka akụnụba, kwuru ọ gaghị ata ụlọakụ 'Central Bank' ụta maka ịmachi cryptocurrency. Omofaye kọwara na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa esichaghị ike, ọ bịakwa bụrụ na enweghị ezigbo nhazi maka cryptocurrency. Anyị ga-ahapụzi bitcoin banye na bitcow - Ndị ntorobịa Naijiria Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa egosipụtala mwute ha dịka gọọmentị etiti machiri ụlọakụ dị icheiche ịnabata bitcoin na 'cryptocurrency' ndị ọzọ. Ụfọdụ n'ime ha na-ajụ na Twitter ma gọọmentị ọ chọziri ka ha mebe 'bitcow'? Nke a na-abịa dịka otu nwoke a ma ama na Twitter bụ Adamu Garba gwara ndị mmadụ ka ha wepụta ego ha na 'cryptocurrency' ma tinye ya n'ahị ịzụ ehi. Adamu Garba dekwara na ebe a nọ ugbua bụ CowtoCurrency. Nke a mere ndị ntorobịa ji ewe iwe ma na-ekwu na naanị ihe gọọmentị Naịjirịa na-akpachapụrụ anya bụ ihe gbasara ehi. Akintomide kwuru na ya ga amalitezi ịzụ ahịa ehi ebe ọ bụ naanị ahịa gọọmentị kwadoro @Marinebabe313 kwuru na ehi dị nnukwu mkpa na Naịjirịa nke mere e ji tinye ya n'akwụkwọ ego narị naịra abụọ Cryptocurrency abụrụla ahịa iwu dịka CBN amachiela ya na Naịjiria Ụlọakụ etiti nke Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria (CBN) na Bekee, amachiela ịzụ ahịa cryptocurrency na Naịjiria. CBN zipuru ozi mmachi a nye ụlọọrụ ndị na-ahụ maka akụnaụba n'ụbọchị Fraịde, dịka ha nyere ha iwu imechi ọbaego onye ọbụla na-azụ ahịa Bitcoin, Ethereum nakwa Dogecoin dị n'aka ha. Mmachi a mere ka ndị Naịjiria ọkachasị ndị ntorobịa na-eti mkpu na-ekwu na gọọmentị Naịjiria kwesịrị ị na-akwado cryptocurrency karịa ịchọ ụzọ ha ga-esi kpachie ya. Cheta na CBN dọburu ụlọakụnaụba ndị dị na Naịjiria aka na ntị n'afọ 2017 sị ha etinyela aka n'ihe gbasara ọzụzụ na orire ego ịntanetị dịka cryptocurrency, ruo mgbe a mara ihe e mere ya, ""n'ihi na ọ bụghị ezigbo ego dịka Naịra"". Ha kwuru mgbe ahụ na ha na-atụ ụjọ na ndị omekome nwereike iji cryptocurrency a ghọgbuo ndị Naịjiria ma gwuo ha wayo. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Etu ị ga-esi tinye ego gị na Bitcoin, Ethereum ka ọ ghara ịda mmiri E nwekwara 'cryptocurrency' dị icheiche ma e wepụ Bitcoin. Ha gụnyere Ethereum, Litecoin, Ripple na ndị ọzọ Cryptocurrency, ọ kachasị nke a kpọrọ Bitcoin bụzi ihe onye ukwu na onye nta kpụ n'ọnụ taa gbasara okwu mmuba akụnụba nke Bekee kpọrọ 'investment'. Onye ntorobịa ọbụla ị kpara aka n'ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin. Mana gịnị bụ Bitcoin? Ọnụahịa otu mkpụrụ Bitcoin na naịra nakwa dọla Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya 'Digital Currency' maọbụ 'Virtual Currency' maọbụ 'Cryptocurrency'. E wepụ Bitcoin, ha dị ọtụtụ ụdị ego a e nwere. Ndị ọzọ niile ahụ ka a na-akpọ 'Altcoins'. Mana Bitcoin bụ nke ndị mmadụ kacha mara ma bụrụkwa nke kacha ọnụahịa. N'ụlọahịa ụfọdụ dị na mba Yurop, i nwere ike ịhụ igwe ị ga-eji were bitcoi kwụọ ụgwọ nke Bekee kpọrọ 'ATM' Otu mkpụrụ Bitcoin karịrị nde naịra anọ (N4 million) Ọ bụ n'afọ 2009 ka otu onye kpọrọ onwe ya Satoshi Nakamoto wepụtara atụmatụ Bitcoin, mana onweghị onye ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ ruo taa. Etu e si eji Bitcoin azụkọrịta ahịa Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya dịka naịra maọbụ dọla N'ihi na Bitcoin abụghị ego a na-ahụ anya, ọ bụ n'igwe kọmputa na ịntanetị ka e si ekesa ya. Onweghị gọọmentị mba ọbụla maọbụ ụlọakụ ọbụla na-ahazi etu e si eji Bitcoin azụahịa. Naanị ndị a na-akpọ 'Miners' bụ ndị na-emepụta ya ma na-ahazikwa etu e si eji ya azụkọrịta ahịa. Ndị ọkacha mara ekwuola na tekịnụzụ a kpọrọ 'Blockchain' ga-abụ nnukwu ihe n'ọdịnihu Etu e si emepụta ụdị ya bụ usoro teknụzụ bụ ọgbaraIgbogharịị a na-akpọ 'Blockchain' na Bekee. Ịkọwa teknụzụ 'Blockchain' ga-abụ akụkọ nke aka ya. Nke a kpatara o ji dị mkpa na mmadụ ga-elezi anya nke ọma tupu o tinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ, iji gbaara okwu na ụka ọsọ. I nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na Naịjirịa? Ọ dịchabeghị mfe mmadụ iji Bitcoin ga zụrụ ọgọdọ maọbụ akpa osikapa n'ahịa Naịjirịa, mana ihe e ji ya eme buru ibu. Nnyocha gosiri na Naịjirịa bụ mba a kacha e ji Bitcoin eme ihe na mpaghara Afrịka niile. Ihe e jikarị ya eme bụ ichekwaba ego nakwa iziga ego si otu mba gaa mba ọzọ. Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara E nwere ụlọọrụ dị icheiche ọrụ ha bụ inyere ndị mmadụ aka ịzụta Bitcoin maọbụ ịgbanwe nke ha nwere nye ha naịra maọbụ dọla. Mana tupu itinye ego gị, anya saa. N'aka nke ọzọ, i nwere ike iji Bitcoin zụta ihe na mba dị icheiche dịka Japan, Switzerland, Germany, Singapore dịrị gawazie. Ihe ndị ọkacha mara kwuru maka Bitcoin Adedayo Adebajo, bụ onye ihe gbasara teknụzụ 'Blockchain' doro anya nke ọma, kọwaara BBC na tupu itinye ego na 'cryptocurrency': Bitcoin o ziri ezi n'iwu Naịjirịa? Ụlọakụ etiti dọrọ aka na ntị ka ndị na-etinye ego ha na Bitcoin hie asaa n'anya. Ka ọ dị ugbua, onweghị iwu ọbụla machiri mmadụ itinye ego ya na Bitcoin maọbụ 'cryptocurrency' ndị ọzọ na Naịjirịa, mana onwekwaghị iwu ọbụla na-akwado ya. Ụlọakụ etiti bụ 'Central bank of Nigeria'dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachapụ anya maka ego ndị a anaghị ahụ anya. Ha kwuru sị: ""Onweghi iwu ọbụla na-echekwa ndị ọbụla tinyere ego ha na 'cryptocurrency'. Oyeisi úlóakú etiti bú Godwin Emefiele na onyeisi ngalaba 'Securities and Exchange Commission' bụ Lamido Yuguda ""Anyị na-adọ ndị mmadụ aka na ntị na cryptocurrency abụghị usoro iwu kwadoro maka azụmahịa na Naịjirịa."" ""Onye ọbụla ego ya furu na cryptocurrency, onweghị ebe onye ahụ ga-aga mee mkpesa, ọ pụtara na ego ahụ alaala."" Mana ngalaba 'Securities and Exchange Commission' wepụtara akwụkwọ ozi n'ọnwa Sepụtemba nke na-ekwu na ha ga-amalite ịhazi cryptocurrency iji gbochie ndị mmadụ itufu ego ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nwaanyị na-ama 'tile'" afirika-57315483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57315483,"'Agbalahụrụ m ọnwụ n'aka ndị gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Amandugba, Imo steeti'","Nwa amadị gbapụtara n'ọnụ ọnwụ n'aka ndị omekome gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Amandugba dị n'Okpuruọchịchị Isu dị n'Imo steeti agwala BBC Igbo ihe ọ hụrụ ụbọchị Mọnde, abalị 31, nke ọnwa Mee, afọ 2021.","Ya bụ nwaamadị na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na anya ya hụrụ ntị ya ụbọchị ahụ. Ọ sị na ya dugara nwanne ya nwaanyị ozi n'Amandugba mgbe ya zutere umuokorobia gbara agba bucha egbe nọchie ụzọ ya bụ ime obodo. Ọ sị na ha kwụsiri ya jụwa ya ebe ha na-aga, ""ka ọ bụ na ha amaghị na e nwere ọnọdụ onye apụla ezi taa?"" Ọ sị na mgbe ya kọwachaara ha, o chipuru n'ike gbapụ ọsọ. Ọ nọzị ebe o zoro hu mgbe ndị omekome malitere ịkụka ụlọmkpọrọ dị na ya bụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ, chụpụchaa ndị mkpọrọ nọ ebe ahụ, mụnye ya ọkụ. Mana ya bụ nwaamadị gwara BBC okwu sị na o nweghị ndị uweojii nọ ebe ahụ mgbe ha mụnyere ọkụ ebe ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'imo steeti bụ Bala Elkana kwetara na a wakpọrọ ya bụ ụlọọrụ ndị uweojii n'Amandugba mana ha chụpụrụ ndị omekome ahụ. Bala Elkana sị na ndị mwakpo ahụ ji otu ụgbọala Sienna, Avalon na ọgbatumtum asatọ gaa ebe ahụ bụ ebe ha na ndị ọrụ ha kwakọtara mgbọ. Ọ sị na ndị ahụ ji egbe ahụ amaghị ndị ha bụ jizi ohere ahụ tụba ọkụ n'ụlọ ebe ihe akaebe ndị uweojii na-adị mgbe ndị ọrụ ha na-akwa ha mgbo n'isi. Ọ sị ndị obodo nyeere ndị uweojii aka gbanyụọ ya bụ ọkụ ndị ahụ tinyere. Elkana sị na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara, ebe ha meruru ọtụtụ ndị omekome ahụ ahụ. Gee olu ya bụ nwaamdị ebe a." afirika-44833359,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44833359,Ekiti Election: Ka ntuliaka ndị Ekiti si ga taata,"Akụkọ na-apụta n'ebe akpọrọ 'Ward 6' n'ime obodo Emure Ekiti n'Ekiti steeti na-ekwu na ndị omempu abataala n'obodo ahụ ebe a na-e,me ntuliaka ị họpụta gọvanọ steeti ahụ na kwa kposasiri n'ebe niile.","Ọ bụ na Ward 6 Emure Ekiti ka nke a mere Akụkọ a kọwara na ugbua, ndị uweojii na-achụ ndị omempu a ọsọ n'ike. N'ime obodo Okehinmi, ndị na-akwado APC na PDP na-atụ onwe ha aka maka ihe ndị ntaakụkọ anyị gosiri n'ihe onyonyo na o nwere ndị na-enye ndị chọrọ ị binye aka n'akwụkwọ puku naira anọ dịka ego mmeru aka. Ndị chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ na-ebekwa akwa na sọsọ ndị chọrọ ibinyere otu APC aka n'akwụkwọ bụ ndị a nyere ohere ibinyere aka n'akwụkwọ, ihe bụkwa ihe ndị ntaakukọ anyị hụru n'ebe ahụ. Na Ward 7, unit 5, nke dị na St Andrews Primary School, Oke Ila, Ado Ekiti, ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ. Akụkọ kọwara na ndị uweojii nwuchiri ha maka ha na-atamu ntamu na ndị 'party agents' na-ebinyeri ndị agadi aka n'akwụkwọ. Ndị uweojii jidekwara onye ntaakụkọ BBC na-ese foto, ma nyụchapụ foto niile o sere na kamera ya. H mechakwara nyechie ya igwe foto ya. N'obodo a kporọ Okehinmi, ndị chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ bokwara ndị APC na ndị uweojii na ọ bụ sọsọ ndị chọrọ ibinyere APC aka n'akwụkwọ bụ ndị enyere ohere ibinye aka n'akwụkwọ. Ndị ntaakụkọ anyị na-ekwu kwa na ụgbọala ruru iri abụọ bụ ihe butere ndịagha bata steeti a n'ehihie taa. Ebe ka ndị agha a na-aga? Ọ bụ n'elekere iri na abụọ nke ehihie ka ndị ntaakụkọ anyị hụrụ ndịagha a. Ndị agha a buru ngwa agha dị icheiche 'Card reader' ekweghi ka onye na-azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ nke otu PDP ka o binyere aka n'akwụkwọ. Eleka na-agba ajụjụ ọnụ ihe mmere 'card reader' ahụghị ọrụ 'Card reader' ekweghi ka onye na-azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ bụ Olusola Kolapo Eleka nke otu PDP ka o binye aka n'akwụkwọ n'ụtụtụ ụbọchị mbinye ntuliaka a. Ọ bụ n'aka elekere itoolu n'ụtụtụ ka Eleka pụtara ibinye aka mana 'card reader' ahụghị akụkọ dị n'akwụkwọ ntụlịaka ya, Eleka jiri iwu pụọ n'ebe ahụ. Ọkammụta Eleka gwara BBC na ya ga-emeri na-ntuliaka a naanị na ya ebinyere aka n'akwụkwọ. Ugbua ka o binyere aka n'akwụkwọ Oge o mesi ka INEC nyere Eleka ohere ibinye aka n'akwụkwọ n'ejighi 'card reader'. Mana onye otu APC bụ Kayode Fayemi ebinyeela aka n'akwụkwọ ka mgbe Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara taa maka ntuliaka a, INEC kwuru na ha di njikere maka ntuliaka a, na kwa na ha na-atụ anya na mmadụ ruru puku isi ga-apụta ịme ntuliaka taa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-57262300,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57262300,Biafra Remembrance : Dike ndị Biafra ji kpaa ike n'oge agha,Ọ karịala afọ 50 Agha Biafra biri mana akụkọ banyere ihe mere nakwa ndị uchu ha tinyere n'ọgụ onye-aghala-nwanne-ya-ahụ mere dike na-ejere obodo ozi adịghị nchefu.,"Lee ụfọdụ dike ndị dị echefu echefu maka ike ha kpara n'oge agha: 1. Odumegwu Ojukwu Dike, Igboji eme ọnụ bụ Onyeisiala Biafra nakwa onyeisi agha ha malite n'ụbọchị Mee 30 nke afọ 1967 bụ ụbọchị ọ mara ọkwa na Biafra bụzị mba aka ya, rue n'abalị asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 1970 bụ oge ọ gbapụrụ ọsọ ndụ ka o nyefechara ọchịchị n'aka osote ya bụ Philip Effiong. Nwa ọgaranya iri ehi na Nnewi, Anambara steeti, nna bụ Louis Odumegwu Ojukwu bụ onyeisi mbụ ""Nigeria Stock Exchange"" ma bụrụkwa ojiegoachuego aha ya na-ada ụda oge ahụ. Emeka odumegwu Ojukwu duru ndị Igbo A mụrụ Ojukwu na Zungeru dị na Niger steeti, mana ọ gara kọleji na 'Kings College Lagos' ebe ọ na-agụ tupu nna ya eziga ya ala Bekee. Ọ gụrụ na mahadum Oxford mecha lagachi bịa sonye ndịagha Naijiria. Ọ rịrị n'ọkwa ndịagha ngwa ngwa dịka ha chọpụtara na ọ gụrụ nnukwu akwụkwọ. Biafra at 50"": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ"" E mere ya govanọ ndịagha na-achị Ọwụwa-Anyanwụ, bụ ọkwa o ji tupu mweghara ọchịchị n'ike na ọgbaghara sochiri nke mere ndi Igbo ji si Ugwu Awụsa gbaa ọsọ ndụ gbalata ala Igbo. Ojukwu bụ ya na Yakubu Gowon bụ binyere aka na nkwekọrịta 'Aburi Accord' bụ ebe Ojukwu tụrụ alo ka mpaghara ọbụla nọọrọ onwe. Ọ nwụrụ n'abalị 26 nke ọnwa Nọvemba afọ 2011 ka ọ gbachara afọ 78. 2. Philip Effiong Dimkpa a bụ onye Ibiono Ibom dị n'Akwa-Ibom bụ Osote onyeisiala mba Biafra afọ atọ Biafra nọọrọ onwe ya. Ọ banyere ọrụ onyeagha n'afọ 1945 ebe o nweta ọzụzụ ndị agha na Naijiria nakwa mba Briten ma soro na ndị Naijiria mbụ rụrụ ọrụ amị. Ọ rịkwara n'ọrụ agha ebe ọ nọọ n'ọkwa dị iche iche gụnyere ịrụrụ Aguiyi Ironsi ọrụ oge nwa amadị ahụ bụ onyeisiala Naijiria dịka 'Principal Staff Officer' tupu e gbuo ya ka e mere mweghara ọchịchị n'ike abalị 29 nke ọnwa Julai afọ 1966. Dịka nwa ya nwoke bụ Ọkamm̀ụta Philip Effiong siri kọwaa, nna nụtara kepkepụ na o nwere ndị agha na-akpa nkata ịchụda Ironsi n'ọchịchị n'ike, gbanyere nna ya ukwu izu. Mana kama izo ohi ụka ahụ ezo ma tinye ya n'ọrụ, Ironsi kpọpụtara Effiong n'ọha otu jịkọrọ ndị agha na-achị oge ahụ bụ'Supreme Military Council' sị ya kwụgharie ihe ọ gwara ya na nzuzo. E mechara ya bụ ihe mezuo dịka a napụrụ Ironsi ọchịchị n'ike n'abalị 29 nke ọnwa Julai afọ 1966. Oge agha dara, Effiong hapụrụ ịrụrụ Naijiriaa, sonyere Biafra ebe ya na Ojukwu rụrụ dịka ndị isi ọchịchị. Philip Effiong rụrụ ọrụ dịka Onyeisiala Biafra dịka Biafra na-abịa na njedebe malite n'abalị asatọ rue abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 1970 dịka Ojukwu gbara ọsọ ndụ gbaga Iviri Kostu. Ọ bụ ya chiliri aka n'aha mba Biafra n'abalị 15 nke ọnwa Jenụwarị nke afọ 1970 na Dodan Barracks dị na Legọs,nke mere ka ọgụ bie. Effiong nwụrụ n'abalị isii nke ọnwa Novemba afọ 2003 ka ọ gbachara afọ 77. 3. Emmanuel Nwobosi Emmanuel Nwobosi ka onye agha Onye obodi dị n'Anambra steeti, Nwobodisi bụbụ onye agha Naijiria tupu ọgụ ada ha. Nwobosi so na ndị agha weghaara ọchịchị n'ike, nke Bekee kpọrọ 'Coup d'etat', n'ọnwa Jenụwarị afọ 1966 Colonel Emmanuel Nworah Nwobosi bụ onye isi ọrụ Ikemba dịka ma sorokwa Ojukwu gaa Ivory Coast bụ ebe ọ gbaghara ka agha biri. Emmanuel Nwobosi so na ndị agha Naịjirịa mechara banyere Biafra n'oge agha Nwobosi, onye sogidere ruo oge Ojukwu nwụrụ n'afọ 2011 lara mmụọ n'afọ 2020. 4. Alex Madiebo Mejọ Generalụ Alexander Madiebo bụ ya bụ onye nke abụọ jiri ọkwa onyeisiagha Biafra, dịka a napụchara Lt Col Hillary Njoku ọkwa ahụ. Ọ banyere ọrụ ndị agha Naijiria n'afọ1954 oge ndịọcha ka na-achị ka ọ gụchara sekọndịrị na 'Government College' Umuahia. Ọ gara ọzụzụ ndịagha na Gana, Briten nakwa Amerịka. O so na ndị agha Naijiria mbụ ezigara mba Kongo maka ọrụ ikpe udo n'afọ 1960. N'afọ 1964, e mere ya onyeisi mbụ nke 'Artillery Regiment'. O si Ugwu Awụsa gbalaa ala Igbo dịka a na-egbusisi ndị Igbo na mpaghara ahụ. Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo Naijiria chụrụ ya n'ọrụ agha mana Biafra nabatara ya nyekwa ya ọkwa ahụ o jibu na Naijiria. Iji kọwaa uchu Madiebo n'oge agha, ọkachamara n'akụkọ ihe mere ochie bụ Ed Emeka Keazor sị, ""Ọ bụ onye agha ọkaibe. Ọ ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ibu agha. Ọ bụ ya gbara nkịtị Achuzia ji kara ya aza aha ndị kpara ike n'Agha Biafra."" Mana Keazor kwuru na ụfọdụ na-ata Madiebo ebo ụta maka ""egosighi olileanya"" oge agha malitere. ""Onye ọbụla ga-achị Naịjirịa ga-ebuuzo meta ndị Igbo mma ka udo chịa n'oge ya"" - Alexander A. Madiebo Madiebo, onye so Ojukwu gbapụ ọsọ ndụ n'abalị 8 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1970, ka dị ndụ ugbua. O deela ọtụtụ akwụkwọ maka ihe anya ya hụrụ n'Agha Bịafra nke gụnyere ""Nigerian Revolution and Biafran War"". 5. Joe Achuzia Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 Achuzia so na otu n'ime ndị ọchịagha Biafra aha ya na-ewu ewu rue echi. Tupu Agha Biafra ebido, Achuzia, onye Asaba na Delta steeti bụ onye injinia na-arụ na Pọtakọt. O kwuru na ya soro lụọ Agha Koria, mana ụfọdụ ndị mmadụ na-agbagha ya bụ akụkọ na ọ bụbụ onyeagha tupu agha Biafra adapụta. Ka o si na dị, Achuzia, onye banyere agha dịka onye agha ọlụọọgbalaga, bụ onye tinyere uchu pụrụ iche n'ọgụ Biafra. Mmeri ndị o nwetaara Biafra mere ka Ojukwu nye ya ọkwa Mejọ nakwa onyeisiagha '11th Battallion' nke Biafra. Oge ndịagha Naijiria chọrọ isi mpaghara Onịcha, Achuzia na ndị ndịagha ya gbochiri ha rue ọnwa abụọ tupu ike Naijiria akarịa nke Biafra nke mere ka Ọnịcha danye n'aka Naijiria. Emeka Keazor kọwara Achuzia dịka ""nwoke kara obi rinne"". ""O nwetara ụfọdụ mmeri ọkachasị oge ọ dị gọọmentị Biafra oke mkpa."" Mana Keazor gbajọrọ Achuzia dịka onye ndụ ụfọdụ ndịagha nọ n'okpuru ya furu n'ihi usoro o ji alụ ọgụ. ""Ịka obi ya mịtara ezigbo mkpụrụ mana ọ tara isi ọtụtụ ndị isi agha ya ""Ya na ndịagha nwere ọzụzụ na-enwekarị nghọtahie n'ihi usoro ya nke ha kwenyere na-ebute ntufu ndụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na Madiebo ejighi Achuzia kpọrọ ihe dịka ọ na-ahụta Achuzia ka ""onye anaghị agbakọ agbakọ"" (reckless tactician/strategist.) Achuzia nwụrụ n'abalị 26 ọnwa Febụwarị, afọ 2018 ka ọ gbachara afọ 80. 6. Okokon Ndem Agha Bịafra abụghị naanị ọgụ egbe na ogbunigwe, e ji mgbasaozi were kwọọ ya bụ nwaanyị ukwu wara. Otu onye aha ya daara n'ọrụ mgbasozi na Bịafra bụ Okokon Ndem nke 'Radio Biafra'. Ọ bụ olu na-agbasa ozi na redio n'oge agha. Dịka ọkachamara n'ihe gbasara ihe meere ochie nke Bekee kpọrọ 'historian' bụ Emeka Keazor si kwuo, ""okwu na-ada ya n'ọnụ ka ofe akwụ. Ọ na-akpalite mmụọ ndị Biafra ma na-akpasu gọọmentị Naijiria."" ""Ndi ọzọ sonyere n'ọrụ mgbasaozi gunyere Patty Davies, Uche Chukwumerije, na Pete Edochie"". 7. Moses Iloh Moses Iloh bụ dike Biafra ọzọ abụghị onye agha, mana onye lụrụ ọgụ n'ihu agha akaghị ya mma. Ọ bụ onyeisi ndị otu 'Red Cross' na-ahụ maka ihe enyemaka n'oge agha bụ ọge agụụ ghụrụ ndị Biafra anya n'ihi mgbochi Naijiria tinyere. Tupu Naijiria enwere onwe ya n'aka mba Briten, Iloh bụ onye otu 'British Red Cross' mana ka ndịọcha lara, ọ bụrụ onyeisi 'Nigerian Red Cross'. Na nri, ọgwụ na ihe enyemaka ndị ọzọ na-erute ndị ọ dịkachasị mkpa na-enweghị wuru wuru ọbụla bụ Moses lloh. Emeka Keazor gwara BBC Igbo sị, ""Moses bụ isi a hụrụ kwawa oku na ịhụ na ihe enyemaka rutere ndị mmadụ n'oge."" ""Ọ bụ onye eziokwu, onye na-akwụwa aka ya ọtọ. Ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị gụnyere ndị nọọsụ nyere aka ikesa ihe enyemaka nye ndị mmadụ."" 8 Col Ejike Obumneme Aghanya na ndị RAP ndị ọzọ A kọwa akụkọ Biafra akọghị akụkọ ike Biafra ji ogbunigwe kpaa, ị mara na onye na-akọ akụkọ ahụ arachabeghị mmanụ ụtụtụ. Ejike Ebenezer Obumneme Aghanya bụ onyeisi 'RAP' (Research And Production), ngalaba na-ahụ maka nchọpụta na Biafra, bụ onye ya na ndị otu ya tipụtara mmọnwụ pịawara ọtụtụ ndịagha Naijiria azụ. Otu ahụ nke ọtụtụ ndị sonyere na ya si mahadum University of Nigeria Nsukka bụ ndị rụpụtara ọtụtụ ihe nke e jiri lụọ aghadịka ogbunigwe, mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ. Col. Ejike Obumneme Aghanya bụ onye agha Naijria atụnyere na mkpọrọ maka ebubo na o soro na ndị kpara nkata iwere ọchịchị n'ike nke Janụwarị afọ 1966. RAP nwere ngalaba na-ahụ maka ime ngwa ahịa, nwekwa ngalaba na-ahụ maka imepụta mmanụ ụgbọala. Benjamin Chukwuka Nwosu Keazor kwuru na Ken Ekezie gwara ya na ndị ya na Nwosu so rụpụta ogbunigwe gụnyere; Seth Nwanagu, Willie Achukwu, Sylvester Acholonu, Nath Okpala, Chimere Ikoku (onyeisi UNN). Onye Ozubulu Anambara steeti, Nwosu bụ ọkammụta 'nuclear physicist' nakwa onyenkuzi na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' tupu agha esu. Nwosu nwụrụ n'abalị 17 nke ọnwa Ọktoba, afọ 2000 ka ọ gbachara afọ 70. Ndị agha merụrụ ahụ n'oge agha Ahụ zuru ha oke oge agha malitere n'afọ 1967, mana ka agha biri, ụfọdụ akụkụ ahụ ha adaala mmiri. Ọ bụrụ na ị gaa n'Oji River dị n'Enugwu steeti, ị ga-ahụ ọtụtụ ndị lụrụ agha nwere ọlụsị dị iche iche bụ nke ha nwetara site ịlụ ọgụ n'ihu agha. Ndị okenye lụrụ Agha Biafra haara referandum karịa ịlụ ọgụ ọzọ Ndị a niile a naghị anụ aha ha, mana haa so na ndị tụnyere aka na ụkwụ n'olile anya inweta ala nke onwe ha. E wezụga ndị a tụnyere aka na ụkwụ, Agha Biafra tara isii ndị Igbo ruru mmadụ nde atọ. Etu ihe siri gaa" afirika-43252814,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43252814,Otu oyiegwu: IPOB agala ụlọikpe mkpegharị,Ipob agaala ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja ịrịọ ka ụlọikpe a nyocha mkpebi kwuru na otu ha bụ otu na-eyi egwu nke a kpọrọ 'terrorist group' na bekee.,"Gọọment etiti mapụrụ IPOB ddịka otu ndị na-eyi egwu Dịka akụkọ siri kwuo, ụlọikpe mkpegharị enyebeghị ụbọchị a ga-ege nti na ikpe ahụ. Cheta na oge gara aga, nnukwu ụlọ-ikpe nọ n'Abuja jụrụ ịkagbu ngụnye gọọmenti etiti gụnyere IPOB dịka ọtụ na-eyi egwu. Onye okaikpe nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụ Jọstis Abdul Abdu-Kafarati, kụpụrụ akwụkwo otu IPOB tinyere iji rịọ ụlọikpe ahụ ka ọ kagbue iwu ahụ gọọmenti mara n'ụbọchị ịrị abụọ n'ọnwa Septemba nke afọ 2017, iji machie otu Ipob." afirika-55522250,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55522250,Ọgba mbọ: Ide mmiri nakọrọ m nde kwuru nde ego ma lee etu m si kulie ọzọ - Cassandara Ndulue,Ọtụtụ mmadụ na-eji ego achụ ego na-ekwu maka ọdachị ha na-ezute n'ụzọ mana nke Cassandra Ndulue metụtara n'ebe ọjọọ dịka udiri mberede o jir bịa.,"Ọdoziakụ Ndule si na ya lapuru ụla were tete chọpụta na azụ niile ọ na-azụ a bụrụla ihe ide mmiri buru jewa. Ọ sị na ihe gafere nde naira iri atọ na isii funarịrị ya n'otu ntabi anya. N'akụkọ a, ọ kọrọ anyị njem ya nakwa etu ya Jiri na edi ihe mere nakwa njem o jere iji chọọ enyemaka iji malitekwe ọzọ. Akụkọ ya na-agba anya mmiri mana ọ na-akwalitekwa mmụo ọfụma. Kirie ya n'uju. Ndị mere akụko a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo." media-53400899,https://www.bbc.com/igbo/media-53400899,Ogochukwu Ihemezue malitere isi nri mmemme ka egwuregwu ji ya baa ọgaranya.,Ogochukwu Ihemezue malitere isi nri ka egwuregwu.,"Ọ nwere mmasị nnukwu na isi nri mmemme nke bụ na ebe ọbụla ana eme mmemme Ogochukwu na-aga enyere ndị ahụ aka esi nri. Obi adịghị nne ya mma maka ya bụ ozi ọ na-aga maka na, na-echiche ya, isi nri bụ ọrụ ụmụnwaanyi. Ugbua, ọgọchụkwụ esiela nri mmemme ihe karịrị afọ iri an ise baa ọgaranya nke bụ na ọrụziri ụzọ obodo ha bụ ebe ụgbọala anaghị bụ agba. Lee ihe onyonyo a ka i hụ ka o si bido nakwa ka o si baa ọgaranya. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke na Chiemela Peter Akụkọ ga-amasị gị" media-54589155,https://www.bbc.com/igbo/media-54589155,Ọgba mbọ: 'E si m n'ighe akara bụrụ 'Councilor' okpuruọchịchị Nnewi North' - Ugochinyere Eze,"Agbanyeghị na Ugochinyere Eze, bụ nwaanyị na-eghe akara, abụrụla 'Councilor' n'okpuruọchịchị Nnewi North dị n'Anambra, ọ ka na-eghe akara ya.","Ndị agbataobi ya na-etu ya ""Honourable na-eghe akara"" maka na Ugbochinyere na-apụta n'elekere isii nke ụtụtụ ghechaa ma ree akara ya tupu ọ gawa ịrụ ọrụ 'councilor' ya n'okpuruọchịchị Nnewi North n'elekere itoolu nke ụtụtụ kwa. Ugochinyere kọọrọ anyị etu ọkwa councilor si ruo ya aka n'ụzọ dị iriba ama. Gere ya n'uju n'ihe nkiri a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51116914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51116914,Uzodinma: Mkpebi Ụlọikpe Kachasị enweghị ebe ọ gbadoro ụkwụ - PDP,Otu pati PDP akpọọla oku ka ỌkaikpeTanko Mohammed rịtuo n'ọkwa dịka ọkaikpe Ukwu Naijiria nakwa onyeisioche otu na-ahazi ikpe bụ 'National Judicial Council'.,"Uzodinma: Tanko rituo dịka ọkaikpe Naijiria - PDP PDP kpọrọ oku a ka ha nwechara ọgbakọ imeobi n'ụbọchị Tọzde n'ihi mkpebi Ụlọikpe kachasị nke napụrụ Emeka Ihedioha nke PDP ọkwa Gọvanọ Imo steeti ma nyefee Hope Uzodịnma nke APC. End of Twitter post, 1 N'ozi nke Onyeisioche pati ahụ bụ Uche Secondus ziri ndị ntaakụkọ, o sịrị na ""Ụlọikpe kachasị nke Tanko bụ onyeisis ya enwezighị ntụkwasịobi, kama ha na-emezi mbunuche gọọmenti APC."" Ha gara n'ihu sị na, ""Mkpebi Ụlọikpe kachasị nke kposara mmerị Emeka Ihedioha (onye nwetara vootu 276,404) ma jiri vootu amaghị ebe o si kpọpụta Hope Uzodimma nke APC, onye nwetara vootu dị 96, 458 dịka gọvanọ Imo steeti bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkapị, ma bụrụkwa ụzọ nwere ike ibute nsogbu. O kwesịrị ka e kpegharịa ya."" Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Kingsley Obiora, nwa afọ Igbo Buhari họpụtara dịka osote onyeisi CBN Kingsley Obiora na Godwin Emefiele Onyeisiala Muhammad Buhari ahọpụtala Kingsley Obiora maka ọkwa osote onyeisi ụlọakụ etiiti bụ CBN. Ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina onye gbara ama a kwuru n'ozi o zigara ụlọọrụ ntaakụkọ na ""Onyeisiala Buhari wegara aha Kingsley Isitua Obiora ụlọomeiwu Ukwu maka nkwado maka ọkwa osote onyeisi ụlọakụ etiti."" A na-atụ anya na Obiora, onye welitere isi n'ụlọakụ mba ụwa bụ IMF ga-anọchi Joseph Nnanna, onye ga-ala ezumike nka n'abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020. Obiora, onye a na-agba ama na ụbụrụ ya na-achọ ọkụ dịka o jiri 'First Class pụta na mahadum gụrụ 'Economics na mahadum 'University of Benin' nakwa Mahadum 'University of Ibadan.' Nwoke gbara afọ iri nanọ na-atọ na- arụ n'ụlọakụ mba. Aka m adịghị na mwepu Ihedioha - Osinbajo Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agọrọla aka ya na ụkwụ ya n'asịrị na-efegharị nke na-ekwu na aka ya dị na mwepu ụlọikpe Supreme Court wepuru Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo Steeti. Laolu Akande ọnụ na-ekwuru Osinbajo, kọwara na akụkọ ahụ bụ fa fa fa - Fawul... maka na otu mkpụrụ eziokwu adịghị na ya. Rochas Okorocha sị na ya adịghị atụ ụjọ nnyocha Hope Uzodinma Onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ya adịghị akụja maka atụmatu nyocha ọbaego Imo steeti aka na-achi Imo bụ Hope Uzodinma kwuputara ụnyaahụ. Gọvanọ Uzodinma kwuru maka nyocha ọbaego a ka ọ na-anabata iyi ọrụ e duru ya na-steeti ahụ, ebe ọ nọ kwuo na ọ na-enye onye nchịkọta akụnaụba steeti ahụ iwu ka o zitere ya ihe gbasara ọnọdụ mkpata na mmefu ego steeti ahụ site n'afọ 2010 ruo ugbua, n'ime ụbọchị anọ. Sinetọ Okorocha dere n'akara Twitter ya na ihe ya ekweghị na ya bụ iji atụmatu nyocha na-amaja ya, ezinaụlọ ya nakwa ndị na-akwado ya. O kwukwara ka ndị odeakwụkwọ mịnịstrị niile nọ na steeti ahụ zitere ya ebe kọntratị niile e kerela na steeti ahụ kwụ akwụ ugbua, ma gbagodu 'brake' n'ọrụ ọbụla a na-arụ. Anyị achọghị 'Eco' Ndị mba ECOWAS na-asụ bekee ajụla atụmatụ ịhọrọ otu akwụkwọ ego a kpọrọ 'Eco' maka nzụkọrịta ahịa na mpaghara ahụ. Ndị DSS akpaala ike Ndị DSS Ndị ọrụ nchekwa DSS azọpụtala ndị ọrụ enyemaka mmadụ ise bụ ndị otu a kpọrọ Islamic State of West African Province ISWAP tọrọ kamgbe afọ gara aga. Mmadụ ise ndị azọpụtara gụnyere Jennifer Samuel Ukumbong, Adabe Cletus, Adamu Auwal, Arthur Ibojekwe China na George Danbaba Michael. Anyi kwadoro Amotekun - Nnamdi Kanu Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob ekwuola na ndi otu ya ga-enye atụmatụ Amotekun nkwado pụrụiche. Na mkparịta ụka omere n'akara Facebook Radio Biafra ụnyaahụ, Kanu sị na Amotekun dịka ngalaba Biafra Secret Service otu Ipob wepụtara bụ nke ọ sị ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ kwaturu. Ọgbaghara Kenya Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ ndị merụrụ mgbe ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii na mpaghara Kasarani dị na Kenya. Ndị a malitere ime ngagharịiwe kamgbe abalị anọ n'ihi ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ dị n'ebe ahụ. Marcus Rashford na-agbara Machester United bọọlụ nwereike ọ gaghị eso gbaa asọmpị ha ndị Liverpool n'ụbọchị Sọnde n'ihi mmeru ahụ. Onye nchịkọta ha bụ Ole Gunnar Solskjaer sị na ọ bụ mkpebi ya itinye Rashford n'asọmpi ha ụnyaahụ kpatara nke a. Ọkụ gbara ụlọobibi ụmụakwụkwọ na Mahadum Michael Okpara Ọkụ gbara IBB Hostel dị na Michael Okpara University Of Agriculture dị n' Umudike Abia Steeti ụbọchị Wenezde. O nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọkụ gbara mana ndị nọ ebe ihe mere kwuru n'ọkụ ahụ gbara akwa na ụfọdụ ihe ha jiri biri. Ụfọdụ rụtụrụ aka na ọ bụ nsogbu si na ngwa ọkụ latrik nwere ike ibute ọkụ ọgbụgba ahụ. Otu nwata akwụkwọ ụklọakwụkwọ ahụ bụ Chukwuemeka Ndubisi kwuru na ọ bụ Ụmụakwụkwọ n'dị nche mahadum ahụ gbakọtara aka menyụọ ya bụ ọkụ. Nke abụghị mbụ ọkụ na-agba na ya bụ mahadum, ọkụ gbara gbara n' ụlọbibi ndị PG mahadum ahụ n'afọ 2015. Mba isii ajụla nkwekọrịta Ecowas inwe otu ego Naijiria na mba ise ndị ọzọ so na mba isii na-asụ bekee nọ n'otu Ecowas akatọla nkwekọrịta ndị mba asatọ ndị ọzọ ndị na-asụ Frnshị maka iji otu ego azụ ahịa n'Ecowas. Ihe Trump mere doro ya anya - Parnas Foto a gosiri Lev Parnas bụ onye ojiego achụ ego si mba Ukren na Amerịka bụ enyi ọkaiwu Onyeisiala Trump Lev Parnas bụ otu onye na-arụrụ Rudy Giuliani bụ ọkaiwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na ihe ọ mere so n'ihe e ji enyocha ya n'ụlọomeiwu ukwu ugbua, doro ya anya nke ọma. Parnas kwuru na ihe Trump na Giuliani nọ na-eme gbasara ndị mba Ukren inyocha Joe Biden bụbụ osote onyeisiala mba Amerịka, na nwa ya nwoke abụghị inyocha mpụ, na ọ bụ imetọ aha onye ya na Trump na-azọ ọkwa. Nke a na-eme ka ndi omeiwu nta n'Amerịka họpụtara mmadụ iri na abụọ ga-agara ha ikpe ichutu Trump N'ọrụ n'ụlọ omeiwu ukwu. Joshua na Pulev Anthony Joshua na Joseph Parker Oti ọkpọ mba Bulgaria bụ Kubrat Pulev na-ekwu na ekpebiela ọgụ ya na Anthony Joshua ka ọ bụrụ n'ọnwa May afọ a. Pulev na-ama Joshua aka iji mara onye bụ ọkaibe na ogoogo IBF, mana Joshua ekwubeghi ihe ọbụla maka ọgụ a. N'egwuregwu, Otu mkpụrụ goolu Juan Mata nyere n'old Trafford, nyere Manchester United mmeri ha ji wee wụbanye n'agba nke anọ n'asọmpi n'Iko FA. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a gbasara ihe ụmụnwaanyị gabigara oge agha Biafra, ga-amasị gị: Etu ụmụnwaanyị Biafra si husie anya n'oge agha" afirika-44206876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44206876,Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa,Otu kporo onweha 'The Coalition of Northern Groups' na bekee gwara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhuri na onye chiburu dịka osote onyeisiala n'oge garaaga bụ Atiku Abubakar na ọ ga-adị mma maọbụrụ na ha abụọ wepuru aka n'ime ọsọ ị banye n'ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2019.,"Muhamadu Buhari agaala ụlọogwụ ugboro ole na ole maka nleta onwe ya Otu a kwuru na ha na-ekwusi okwu ike makana ha abụọ bụ Buhari na Atiku karịrị afọ iri asaa na kwa na ndị ntorobia kwesiri ị bụ ndị ga-achị Naịjirịa ugbua na kwa n'iru. Ha kwukwara na ọ bụ ndị chiburu Naịjiria n'oge garaaga burukwa ndị ka goro nka bụ ndị mebiri Naịjirịa, na kwa oge eruola ndị ntorobia buru Naịjirịa gawa ala ekwere nkwa. Otu ha kwuru okwu a n'ime akwụkwọ a dere na ngwụcha ọgbakọ ha na Kaduna n'ụbọchị Monde. Atiku Abubakar anwaala ugboro ole na ole ị bụ onyeisiala Naijiria Cheta n'ọbụ ndị otu a sị ka ndị Igbo bị na mpaghara ugwu hausa kwara lawa. Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu azaala otu a. Shehu kwuru na onweghị iwu ọbụla na Naịjirịa kwuru na onye karịrị afọ iri asaa anaghị enwe ike ị so n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa. Onweghị ihe Atiku Abubakar kwuru ugbua maka okwu a otu nke a na-ekwu. Otu a kwukwara na ihe kachasị dị ha mkpa bụ ka gọọmentị leba anya na ntụlịaka maka ị nwere onwe nke a kpọrọ 'referendum' na bekee." afirika-44890388,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44890388,Mmadụ 164 tọrọ na Russia amalitela njem ịlọta Naịjirịa,"Ụgbọelu gọọmentị Naijiria zigara mba Rọshịa ibulata ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ eruola Rọshịa, dịka Yulia Siluyanova, bụ onyeisi ndị na-arụ ọrụ n'efu akpọrọ Alternativa, gwara BBC Igbo.","Oluremi Kehinde (yi uwe manụ manụ) so na ndị na-enyere ndị a tọrọ aka na Rọshịa Siluyanova kwuru na ụmụ Naịjirịa karịrị otu narị bụ ndị mbụ n'ime mmadụ tọrọ atọ na Rọshịa eruola ọdọ ụgbọelu nkwado maka ịlota Naịjirịa taa. E bugharịrị njem ha rue elekere isii nke ụtụtụ taa (elekere nke ndị Rọshịa), ma mecha tinye ya na elekere iri na abụọ nke ehihe maka inye ndị na-akwọ ụgbọelu ohere ezumike tupu ha ebido ịlaghachi. Mmadụ karịrị 200 tọrọ atọ na Rọshịa dịka emechiri asọmpị Iko Mbaụwa na Rọshịa ụbọchị ole na ole gara aga. Ụfọdụ kwuru na e gwuru ha wayo n'ikagbu akwụkwọ njem ha bụ 'ticket' na bekee n'agwaghị ha. Ndị a karịrị otu narị ga-abụ mbụ ga-alọta site n'aka gọọmentị Naịjirịa. Cheta na Alternativa, nke Yulia Siluyanova bụ onye isi ha, kwuru na ha kpọlatara ụfọdụ n'ime ndị a tọrọ, ma na-enyekwa ndị fọrọ nrị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45160506,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45160506,A gbagbuola ndị uweojii anọ na Kaduna,Ndị uweojii na Kaduna steeti kwuru na ndị oji egbe aga gburu ndị otu ha anọ ụnyaahụ n'obodo Jankasa nke dị nso obodo Rigasa dị n'okpuru ọchịchị Igabi na steeti ahụ.,"Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Onye kwuru nke a bu ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kaduna steeti bụ Sabo Yakubu. Yakubu kwuru na mgbede ụnyaahụ ebe elekere isii, ndị uweojii nọ ọrụ na Jankasa danyeere ndị omekome. ""Ka ha na ndị omekome a gbakọrọ egbe, mmadụ ano n'ime ha lara mmụọ,"" Yakubu kwuru. Ndị ji egbe aga na-akpa ike na mpaghara ụfọdụ na Kaduna, ọkachasị etiti Birnin Gwari ebe a tọọrọ mmadụ 80 n'ọnwa Mee nke afọ a." afirika-47585407,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47585407,Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta,"Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala ""tanker"" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha.","O kwuru na ka ọ mapụchara na 'Keke' bu ya, ụgbọala tanker ahụ kwọgbuo ndị ya na ya so. Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a. Building collapse: Ihe isii mere ọtụtụ ụlọ ji ada" afirika-43525075,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43525075,Obidigbo: Napụnụ ndị ọchị-ehi egbe,"Onye zọburu ọkwa Gọvanọ Anambra steeti bụ Chike Obidigbo agwala gọọmenti ala Naịjiria ka ha napụ ndị niile na-achị ehi egbe ozigbo ozigbo, iji were kwụsi ndu ndị mmadu ha na-ala n'iyi.","Chike Obidigbo zọburu ọkwa gọvanọ, Anambra steeti Obidigbo kwara arịrị n'ọgụ na igbu mmadu na-aga n'ihu n'ala anyi ga-ekewa Naijiria n'oge na adịghị anya ma ọ bụrụ na gọọmenti kachie ntị hapụ ndị a kpọrọ onwe ha ndị Fulani na-achị ehi ka ha buru egbe na mma. Ọ kọwara na ndị na-akpa ike a ji aha ndị ọchị ehi na-emechi na ha bụ ndị e goro ego ka ha bịa tisaa Naijiria. Obidigbo nyere goomenti ndụmọdọ ka ha were ngwa ngwa nasịsịa onye ọbụla na-achị ehi egbe na mma ma takwa ndị niile dara iwu ala anyị ahụhụ na agbanyeghi agbụrụ onye si. O kwuru na ya aghọtaghị ihe mere na onwebeghi onye ọchị-ehi atara ahụhụ ka mgbe ha gburu ndị mmadụ na obodo dị iche iche dịka Benue,Kogi, Enugu, Abia,Kogi na ndị ọzọ. Ihe na-ebutekari ọgụ a bụ na ndị ọchị-ehi na-achiba ehi ha n'ugbo ndị mmadụ ka ọ ga tachasia ihe a kọrọ n' ugbo, nke mere na esemokwu na-adaputa mgbe niile. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-57338458,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57338458,Onions traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka ịyabasi anyị a bụsara n'Imo',Otu jikọrọ ndị Ugwu awụsa na-aka ma na -ere ahịa ịyabasị a kpọrọ 'Onion Producers and Marketers Association of Nigeria (OPMAN) ekpebiela na ha ga-akwụsị ibute ịyabasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.,"Odebeego otu ahụ bụ Ibrahim Haruna gwara BBC Igbo ụbọchị Tọzde na nke a bụ n'ihi na ndị otu Ipob zusara ịyabasị juru ụgbọala 'trailer' abụọ nke ego ya ruru nde naira iri abụọ ụbọchị ụka gara aga. O kwuru na ndị otu ha nọ n'Ugwu Awụsa kpebiri ịkwụsị ibunye ha ahịa dịka onye ndụ otu Ipob bụ Nnamdi Kanu emejupụtaghị nkwa o kwere ịkwụ ndị emebiri ahịa ha ụgwọ ya. Cheta na Nnamdi Kanu nọrọ n'ozi ọ gbasara n'abalị 31 nke ọnwa Mee, afọ 2021(31/5/2021) katọọ ndị wakporo ndị Ugwu bụ ịyabasị, ma kwe nkwa ịkwụ ha ụgwọ ya n'uju. Gee ihe ndị a niile n'ihe onyonyo a:" afirika-43816698,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43816698,Akụkọ kachasi n'abalị a: E zurula ọfọ ndị Sineti,Mkpa mkpa kpara n'ụlọ ọrụ Sineti taa,"Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a Ndị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti Otu onye sineti achụrụ n'orụ Sịnetọ Ovie Omo-Agege kpọrọ ndị agboro baa n'ịme ụlọọrụ Sineti ga buru ọfọ ha. Ndị uweoji anwuchiela ya ebe ndị sinetị nyere ha na ndị agha otu ụbọchị iji chọta ọfọ ahụ. Na mba Africa, Goomentị Zimbabwe achụọla ndị nọsụ puku iri maka ị gba abụbọọrụ ha na-eme iji gosi iwe ha maka ụgwọ orụ eji ha. Ndị nọsụ ahụ kwuru na ha anụla mana abụbọrụ ha ga aga niru. Mana Gọọmentị a ga-ege ntị? Komishona na-ahụ maka oke gbasara nwaanyị na India bụ Swati Maliwal jisiike na-akwụ agụ nrị maka nwaakpo na ogbugbu emere nwata nwaanyị dị afọ asatọ. Ọ na-eme nke a iji mee ka uche gọọmentị ha dị na oke mwakpo ụmụnwaanyị na-aga biga na mba India. Na akụkọ egwuregwu Uche Nwofor na Ugonna Uzochukwu edenyela aha n'otu egwurewgu bọọlụ bụ Enugu Rangers FC. Nwofor na Uzochukwu bụ bụ ndị gbara otu supa egus bọọlụ na asọmpị CHAN. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ihe ise ị kwesiri ịme tupụ ị bu ezigbo otiegwu - Phyno" 48130560,https://www.bbc.com/igbo/48130560,Security Votes: Magu kwesiri isekpu ala rịọ anyị mgbaghara- Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ,"Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ nke Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi ekwuola na okwu si n'ọnụ onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu nke na-ebo ndị gọvanọ ebubo ime 'dum-chụpụ, dum-chọọ' n'okwu nchekwa pụta bụ okwu ataghị eze nke o kwesiri ịrịọ mgbaghara maka ya.","Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu. N'ụbọchị Wenezde n'Abuja, Magu nọrọ n'ọgbakọ nkuzi e nwere maka ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị na-alọghachite boro ebubo na ndị gọvanọ na-afụnye ọkụ na nsogbu nchekwa iji nweta ego pụrụ iche maka ọrụ nchekwa nke a kpọrọ ""Security Vote"" na bekee. Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC Ọ sịrị : ""Anyị nwere ihe akaebe na-egosi na ụfọdụ ndị gọvanọ ji maka nsogbu nchekwa na-ezu ego ọha mmadụ."" Mana n'osịsa nke Govanọ Umahi nyere site n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ya bụ Emmanuel Uzor, o kwuru na okwu Magu abụghị eziokwu. ""Ihe Magu kwuru abụghị ihe kwesịrị isi n'ọnụ onye ọrụ nchekwa pụta. O gosiri na Magu amaghị ọrụ ya."" ""Magụ kwesịrị ịghọta ụbọchị onye ọbụla bụ gọvanọ na-ebinye aka n'akwụkwọ dịka gọvanọ, ihe ị "" na-ebinye aka ichekwa ndụ na akụnaụba ndị obodo gị."" ""O nweghị onye ọbụla ṅụjuru ara afọ ọ ga-amasị na ndị obodo ya na-anwụsịsị ka o were na-enweta ego."" Ọ gara n'ihu kwuo na Magu kwesịrị ""igbu ikpere n'ala rịọ ndị gọvanọ maka ihe o kwuru adịghị mma."" Akụkọ ga-amasị gị:" media-44626330,https://www.bbc.com/igbo/media-44626330,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị nche awakpoola Ezekwesili,Ezekwesili na-ebe akwa na ha nwakporo ya,"Onye bụbụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Oby Ezekwesili ekwuola na ndị uweojii, ndị agha na ndị DSS wakporo ya ụnyaahụ oge ọ na-eme ngagharị iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ mere na Platu steeti. Ezekwesili dere n'elu twitter ya na ha wakporo ya n'ihu ụlọ obibi onyeisiala nara ya ọkọlọtọ ya. Ha atọhapụọla Eyinnaya Abaribe Ndị DSS atọhapụọla Abaribe bụ onye ha ji kemgbe abali Juun 15 gara aga n'okpuru ihe ndị Bekee kpọrọ Administrative bail. Onye mgbasaozi ya bụ Uche Awọm gwara BBC Igbo na Abaribe ga-alaghachị ọrụ taa. Ndị ọchịehi ji egbe egbuola ndị agha abụọ n'obodo Goma n'ime Benue steeti Akụkọ kwuru na ha wakporo ha oge ha na-achọ onye gwuru nnukwu olulu n'ọkpọrọ ụzọ n'ime obodo ahụ. Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa N'Afrika, Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa kwuru na ya na-eche na nwuye onye chiburu ala ha bụ Grace Mugabe chọrọ igbu ya. Mnangagwa na-ebo otu nwunye Mugabe na ha tụrụ ogbunigwe gburu mmadụ abuọ ma meruo mmadụ iri anọ ndị ọzo ahụ. Obi agbawaala ndị Naịjirịa N'egwuregwu Umu Naijiria na-ebe akwa na social media na ha gbapuola Naịjirịa n'asọmpi Iko mabụwa. Mana onye nkuzi ha bụ Gernot Rohr na-enwe olile anya na ha ga-eme karịa n'afọ 2022 na Kata. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Plateau: Anya m hụrụ ihe dị egwu" afirika-44340750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44340750,Fayemi: Kedu ihe mere n'emume ndi APC n'Ekiti,"Ndị otu pati All Progressive Congress (APC) nke Ekiti steeti na-ekwu na ọgbaghara mere n'ebe ha na-eme ọgbakọ ha jiri nabata Kayode Fayemi, bụ onye bụbụ Mịnịsịta na-ahụ maka ọla na ihe ndị ọzọ a na-egwupụta n'ala bụ ohere ndị mmadụ jiri chọ igbu Fayemi.","Fayemi Chịbụrụ Ekiti site afọ 2010 ruo afọ 2014 Na akwụkwọ mgbasaozi APC Ekiti weputara n'abalị ụnyaahụ, onye na ekwụchitere ha bụ Taiwo Olatunbosun kwuru: ""Ndọrọndọrọ ọbara alagachitela Ekiti, ka Kayode Fayemi zere ogbugbu a chọrọ igbu ya n'Ado-Ekiti, isi obodo Ekiti steeti. ""Fayemi rituru n'ọkwa dịka Minista n'ụbọchị Wenezde were lata Ekiti ka ndị APC na-emere ya mmemme. ""Site ọdọ ụgbọelu nke Akure ruo Ikere-Ekiti, ebe mmadu puku na puku nọ na-eche ya pụtara nabata ya nke ọma, nsọgbụ adịghị. Ọ bụ mgbe ọ gara Adọ-Ekiti, n'ụlọ otu ndị APC ka onye yi uwe ndị uweojii gbapụrụ egbe n'etiti Fayemi, mgbo metụtara Opeyemi Bamidele na ndị ọzọ."" Ihe mere n'Ekiti steeti Akwụkwọ ozi a gakwara n'ihu kọwa na e buru Bamidele na ndị ọzọ mgbo metụtara gawa ụlọọgwụ mmụta nke Mahadụm Ekiti steeti di kwa n'Ado-Ekiti. Ndị ọzọ mgbo metụtara, dika Olatunbosun siri kwuo, bụ Olabode Joshua, Olanrewaju Gbenga, Adebayo Ogunjemilehin, Ogunmodede Oluwole na Alex Adeleye. Ndị APC tinyere ọnụ na ya bu okwu na Twitter. Mana, ndi uweojii na-akọwa na ọbụghị eziokwu na onye ahụ yi uwe ndị uweojii bịara igbu mmadụ. Na nkọwa ha, ha kwuru na onye ahụ yi uwe ndi uweojii bu onye uweojii n'ezie. N'okwu ha, onye uweojii ahụ soro onye ndọrọndọrọ si Legọs bịa Ekiti. Ha kwukwara na ọbụghị anya ọma ka ọ jịri gba egbe a, na ọ bụ mmehie. Ndi uweojii kwukwara na ha na-eme nyocha maka ihe mere. Cheta na Fayemi ga-azọ ọchịchi ka gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julai afọ a. Fayemi chịbụrụ steeti ahụ ka gọvanọ site 2010 ruo 2014. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-45240669,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-45240669,Lee mịnịsta nya ịnyịnya igwe gaa ịmụ nwa n'ụlọọgwụ,Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na mba New Zealand ji ịnyịnya igwe nke Bekee kpọrọ 'bicycle' gaa ụlọọgwụ ịmụ nwa mbụ ya.,"Julie Genter dị ime izu 42, kwuru na o ji ịnyịnya igwe ahụ gaa ka ime mewe ya ọfụma makana ""enweghị ohere dị n'ime ụgbọala maka ndị na-akwado anyị"". O tinyere foto ya na enyi ya nwoke n'Instagram ka ha abụọ na-egoli ""ọmarịcha ụtụtụ Sunde a"". End of Instagram post, 1 Genter dị afọ 38, bụkwa minister na-enyere onye nke na-ahụ maka njem aka, bụ onye ama ama n'ikwado ịnya ịnyịnya igwe. Genter ga-anara ezumike onye mụrụ nwa ọhụrụ ọnwa atọ, esonyela n'ọnụọgụgụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mụrụ nwa ka ha nọ n'ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52987470,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52987470,Coronavirus: Ihe mere m ji asachasị ebe a na-agwọ ndị bu coronavirus,Damoah Asareh nwafọ mba Gana na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị bu coronavirua akọwala ihe ọ na-agabiga n'ọrụ ya.,"Ọ sị na ọ na-eme nke a iji nyere ndị a aka. Ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na ụjọ na-atụ ya n'ọrụ a mana ndị a bụ mmadụ ibe ya. Na ọ bụrụ na ọ bịaghị, na onye ga-enyere ndị a aka? Asareh sị na nke ọzọ bụ na ọ hụrụ ọrụ ya n'anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54340617,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54340617,US presidential debate 2020: Joe Biden o nwereike imeri Trump bụrụ onyeisiala Amerịka?,Joe Biden bụ otu onye kwụchịrị Donald Trump na afọ anọ ọzọ n'ọkwa oche eze na White House.,"Ọ bụbu osote Barack Obama, mgbe Obama chịrị Amerịka. Ugbua, a họpụtala ya ka onye ga-anọchịanya Democratic Party na ntuliaka ga-eme na Novemba (2020). N'anya ndị nkwado ya, ọ bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mba na mba na Washington, nke ma etu esi ekwuru ọha okwu ga-amasị ndị nkịtị. Ọ bụkwa nwoke biferela ụfọdụ ihe mberede na ndụ ya. N'anya ndị na-ahụghị ya n'anya, ọ bụ onye na-akwado ndị na-emekarị mmeghe. O tozuru ịkwatu Trump na White House? Onye na-ekwu okwu ọsịịsọ Joe Biden bara ndọrọndọrọ tupu amụọ ọtụtụ ndị na-atụ vootu taata Biden abụghị onye ọbịa nye ndị na-azọ ọkwa ọchịchị - ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị na Washington site ụlọomeiwu US n'afọ 1973 (afọ 47 gara aga) ma mgbe mbụ o so kwado onyeisiala bụ n'afọ 1987 (33 gara aga). Ịchọ ndị ga-atụrụ ya vootu, ma bụrụkwa onye okwu juru ya n'ọnụ ka ogbunigwe. Nke a bụ ugboro atọ ya ịzọ ọkwa onyeisiala maka na o chezọrọ onwe ya wee gbarụọ ndị igwe obi ka ọ malitere ikwu okwu. Biden ma ekwuru ọha okwu mana ọ na-eji ọnụ akpatara onwe ya isiokwu ọjọọ mgbe ụfọdụ N'ọgbakọ ịchụnta vootu, o bidoro kwuwe na: “Ndị nnanna m rụrụ ọrụ ebe an-egwupụta koolu na nọt-ist Pennsylvania” nakwa na iwe bụ na ha enwetaghị ihe tozuru ha. Mana onweghi otu n'ime ndị nna nna ya rụrụ n'ebe ana-egwupụta koolu - o zurula okwu ahụ (na ndị ọzọ) n'aka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ndị Briten; Neil Kinnock, onye ndị ezi ya bụ ndị ngwupụta n'ezie. Nke ahụ na ndị ọzọ socha n'ihe ndị akpọrọ ogbunigwe Joe “Joe Bombs”. Ka ọ na-etu ọnụ maka ahụmihe ya n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2012, ọ gwara igwe aghọtachaghị ihe na: “Ndị nke m, aga m agwa unu na amatala m ndị isiala (Amerịka) asatọ, amaruru m atọ n'ime ha ruo ụlọ,” n'amaghị ama, ọ na-asị na o dinarala ha kama ịsị na ha bụ ezigbote enyi. Biden bụ osote Barack Obama site 2009 ruo 2017 Ka osote onyeisiala Obama na 2009, o miri ndị mmadụ ụjọ mgbe ọ sị na ""anyị nwereike ịdaruo 30% ịzọpụta ego mba Amerịka"". Ihuọma mere o jiri bụrụ onye a họrọ ịbụ osote onyeisiala onyeisiojii nke mbụ n'Amerịka ka ọ kọwara ya ka ""onye isiojii nke mbụ ma okwu ekwu ma bụrụkwa nwoke mara mma n'anya"". N'agbanyeghi okwu a, nkwado ndị isiojii ebe Biden nọ ka kwụrụ chịm n'ịchụnta vootu ugbua ana-azọ ọkwa isi oche n'Amerịka. N'oge etebeghi aka, mkparịtaụka ya na onye ntaaakụkọ onye isiojii bụ Charlamagne Tha God rtụgharịrị mgbe o kwuru sị: ""Ọ bụrụ na ị maghị onye ị ga-atụnyere m maọbụ Trump, ya bụ na ị bụghị onye isiojii."" Biden mere ihe iribama mgbe ọ na ihe onyonyo redio nke Charlamagne Tha God na-ahazi Otu ahịrịokwu ahụ bụ mbido ezigbo esemokwu nke bụ na ndị ọrụ ya gbalịrị ịkọwa na o nweghi ihe ọ kpọrọ ụtụ vootu ndị isiojii bi n'Amerịka. Anụ ochie n'ịchụnta vootu Biden adịghị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ, izuta ndị na-atụ vootu na-amasị ya Mana o nwere aka ọzọ n'okwu ya - n'ụwa ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-atụ asị, o soghị, e ji anya onye kwụrụ ọtọ ele ya. Ọ sị na o cheta ka o si agụ ihe mgbe ọ bụ nwata, ọ gaghị achọ ịgụpụta okwu ya n'akwụkwọ kama, ọ ga-achọ ka o kwuo ihe si ya n'obi. Biden emeriela ntuliaka asaa nke ụlọomeiwu na US Biden na ndị Amerịka gụnyere ndị ọrụ na ndị gbakọtara ị gee ya nti na-emekọrịta ka o ti egwu ama ama. Mana ugbua etu a o si emekọrịta ma na-emetu ndị mmadụ aka abụrụwala nsogbu. Ebubo Ọtụtụ ụmụnwaanyị e bola Biden ebubo maka agwa ya Ụjmụnwaanyị ruru asatọ biara na-ebo Biden ebubo na ọ na-emetụ ha, makụọ ma susuo ha ọnụ nke ụlọọrụ onyonyo mgbasaozi nọ na mba US goskwara etu o si bia ezigbo nso ma o na-ekele ụmụnwaanyị n'emume ha ụfọdụ. Mana Biden ekwuola na ọ ga-akpachapụ anya na etu o si emekọrịta n'ọha. Mana n'ọnwa Maachi ka Tara Reade,boro ya ebubo na o kwagidere ya na wọọlụ ma kwaso ya iko kamgbe afọ iri atọ. ""Believe survivors"" abụrụla okwu ama ama kamgbe ọtụtụ afọ gara aga Biden agọọla aka na ụkwụ maka nke a site akụwkwọ ozi ụlọọrụ achụmnta vootu ya wepụtara nso nso a. Ndị Democrats na-akwado onye ha chorọ ka ọ bụrụ onyeisiala ha ga-ekwu na ọtụtụ ụmụnwaanyị apụtala boo onyeisiala Trump ebubo ikwaso ha iko mana e nwereike ibutu udiri omume a n'egwuregwu ọnụ ọgụ Kamgbe mkpụ #MeToo malitere, Democrats gụnyere Biden na-ekwuis ike ka obodo kwete ụmụnwaanyị makana ihe ọbụla e mere iji gbaa ebubo eboro ha nkịtị ga-eme ka ndị na-azọta ikike ahụ ghara ịṅụ mmiri tọgbọ iko. N'ajụjụ ọnụ agbara Reade nso nso a, o kwuru, ndị nke Biden agwala m ọtụtụ ihe na-agba obi ma na-ekwukwa maka m na soshal midia. Ọgbakọ achụmnta vootu Biden agọọla ebubo a. Igbalahụ nzọghie ụkwụ a Hilary Clinton bụ onye kacha nwee ihe mmụta gbasara ọchịchị mana Donald Trump meriri ya na ntụliaka onyeiaiala 2016 Ndị nso nso Biden na-eche etu o si anabata ndị mmadụ ga-azọpụta ịdanye n'ọnya ndị Democrats zọgoro ọkwa onyeisiala n'oge gara aga na-adanyekarị. O nwetela ọtụtụ ihe mmụta na Washington , afọ iri atọ n'ụlọ sineti nakwa afọ asatọ dịka osote onyeisiala Barak Obama, mana ụdịrị mbọ niile ọ gbara a gaghị enyecha aka. Ndị nso nso Biden na-eche na etu a ọ dị umeala, na ọ gaghị adanye n'ọnya nghọtaghie. Obama gbadoro achụm nta vootu na iweta mgbanwe n'afọ 2008 mana ọ ga-ahiara Biden ahụ imenwu udiri ihe a. N'ihe karịrị otu mgbe, ka ndị mba Amerịka ga-atụnyere onye na-azọ ọkwa onyeisiala gaa bụgharịa ọnọdụ ndọrọndọrọ nọ n'ụlọ ahụ. Mana nke a ga-arịa ahụ makana Biden a nọọla na ndọrọndọrọ ọchịchị ruo afọ iri ise nke e nwereike iji megide ya. Ndọti ihe mere mgbe gboo Biden bu ụzọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 1987 N'oge afọ 1970, o dọnyere ndị na-akpa oke agbụrụ bi na ndịda n'imegide ụmụaka ndị ọzọ si ebe ọzọ nke gosiri ịkpa oke agbụrụ. Ndị otu Republicans na-ekwu na Robert Gates bụ odeakwụkwọ Obama kwuru na Biden bụ onye ọtụtụ mmadụ ga-ahụrịrị n'anya mana ọ daala n'atụmaatụ mba ofesi nakwa nchekwa obodo kamgbe afọ iri anọ. Ya chere aka ghọrọ udiri okwu a dịka a na-achụ nta vootu ịzọta ọkwa onyeisiala ugbua. Ihe mberede ezinaụlọ Ihe mberede okporoụzọ tara isi nwunye Biden a kpọrọ Nelia na nwa ya nwaanyị Ọ bụ ihe nwute na otu ihe mere ka ọ dịka Biden a nọpụrụ anọpụ na ndọrọndọrọ bụ otu ihe metụrụla mmadụ niile - ọnwụ. Ka ọ na-akwado ka ọ banye ọkwa sineti ka o merichara ntụliaka ya nke mbụ, nwunye ya bụ Nelia nakwa ada ya nwaanyị Naomi nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala nke merụrụ ụmụ ya nwoke abụọ ndị ọzọ (Beau na Hunter) ahụ. Nwa nwoke Biden akpọrọ Beau bụ onye ọkaikpe nakwa onye agha n'Iraq Beau mechara nwụọ maka ọrịa ụbụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara afọ 46. Ndị Amerika ka ghọta nsogbu arịrị ọnwụ ndị Biden hụrụ n'anya buterela ya makana a gbanyeghị na ọ bụ onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa akụ na ụba ya, ụfọdụ ihe merela ha emetụla ya. Mana e nwere akụkọ pụrụiche gbasara ezinụlọ ya, nke a metụtara nwa ya nwoke Hunter. Ike, nrụrụaka na ụgha Hunter Biden ebuterela ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya ọtụtụ mgbagoju anya Hunter bụ ọkaiwu nakwa onye na-achụ ihe n'ike tupu ihe gbasara ndụ ya mgbe ọ nọghị n'ihu ọha ewetewe nnukwu nsogbu. Nwunye ya nke mbụ boro ebubo ibu ọgwụ ike n'akwụkwọ mgbasa alụm di na nwunye ha, a tụpụkwara ya n'ụlọ ọrụ ndị agha mmiri Amerịka ka achọpụtachara na o bu 'kokain'. Ihe nrụrụaka ndị a Hunter metarala eweterala nna ya Biden ajọ akụkọ n'ụlọọrụ mgbasaozi dị iche iche n'Amerịka. Ndị Amerịka nwereike ịghọta ihe gbasara onye ya mmasị o nwere n'ebe ọgwụ ike dị na-agbarị mana ebe ọ bụ na Hunter ejirila agwa ọjọ a ma na-arụ ọrụ ebe a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ ọnwa gosiri etu ndụ si diri ndị otu ndọrọndọrọọchịchị dịka Biden. Nwepụ n'ọchịchị E wepụrụ Trump n'ọchịchị mana ndị sineti mechara hụ na aka ya dị ọcha nke mere na ewepụghị ya n'ọchịchị Ụfọdụ ọrụ a ebe a na-akwụ ezigbo ụgwọ ọnwa gụnyere Ukraine, nke mere ka a na-eche na onyeisiala Trump kwuru ka ụlọ ọrụ onyeisiala mewe Hunter nyocha maka nrụrụaka. Nkata n'ekwenti ahụ mere ka atụwa alo iwepụ Trump n'oche onyeisiala, ma ha emenwughị ya, mpịtọ ndọrọndọrọ Biden ga na-eche na ọ karịghị ịmanye aka. Ihe gbasara mba ofesi Biden nwere ọtụtụ ihe mmụta gbasara mba ofesi Nrụrụaka mba ofesi ọbụla agaghị a dịrị Biden mma makana e ji ọkaibe n'ihe gbasara mmekọrịta mba ofesi wee mara ya. Mana amabeghị ma ndị ga-atụ vootu a ga-ebu nke a n'obi n'ụbọchị ntụliaka. A na-eche na mkpebi Biden mere inye vootu megidere atụmaatịụ ndị agha gbasara agha Gulf mbụ kpatara na ọ zọghị ọkwa onyeisiala n'afọ 1992 A chịkọta ndọrọndọrọ ọchịchị ya niile, a ga-asị na o ji nwayo nwayo azọnye ụkwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ tụrụ vootu megidere agha Gulf n'afọ 1991, nke kwadoro mwakpo mba Iraq n'afọ 2003 mana katọọ nsonye mba US n'ebe ahụ. Ọ dụkwara Obama ọdụ ya ezipụla ndị agha gara gbuo Osama Bin Laden. Ihe ndị mere ka ụfọdụ ndị Democrats na-azọ ikike sewere ya ihu. Mana ndị mmadụ ga-apụta n'ọnwa Nọvemba ga-atụọrọ ya vootu. Ihe niile maọbụ enweghị ihe ọbụla ma ncha Ma o meriri ma o merighị, ihe a ga-abụ agba ikpeazụ nke ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị Biden Mpụtara ntụliaka nyocha na-egosi na Biden ji pọinti ise ruo iri aga Trump dịka ha na-azọ onye ga-abanye n'ụlọ ọcha mana ntụliaka nke Nọvemba ka tere aka, a ga-enwekwa ọtụtụ ọgụ n'ihu tupu oge ahụ e ruo. Trump na Biden esela okwu maka mwakpo ndị uweojii na-awakpo ndị isi oji nakwa etu gọọmenti si hazie ihe gbasara ntiwasa coronavirus. Mana o nwere ọtụtụ ihe ka ihe ndị ahụ mkpa. Ọ bụrụ na Biden merie, ọ ga-abụrụ ya okpu eze e kpukwasịrị n'isi ndọrọndọrọ ọchịchị o maliterela kamgbe, mana ọ merighị ọ ga-abụ iwere ọchịchị nyefe n'aka nwoke o chere ekwesih=ghị ichị Amerịka nakwa onye ""a gaghị atụkwasinwu obi."" N'oge na-adịghị anya, mgbe ọ na-eche ma ọ ga-aba n'ọsọ onyeisiala nke 2016, Biden kwuru na ọ ga-anwụli dịka nwoke nwere obi aṅụrị maọbụghị onyeisiala."" Nke ahụ abụghịzi uche ya ugbua." afirika-56688101,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56688101,Imo Prison Break: Ọ bụ otu Gọvanọ chịburu Imo steeti haziri ndị wakporo ụlọmkpọrọ n'Owerri - Declan Emelumba,"Dịka a ka na-achọ ndị ekperima wakporo ụlọ mkpọrọ nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owere n'ụbọchị ise nke ọnwa Eprel 2020, Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti bụ Declan Emelumba ekwuola na ọ bụ otu onye bụbu gọvanọ Imo Steeti haziri ndị ekperima mere ya bụ mwakpo.","Declan Emelumba bụ Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti Emelumba kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Owere n'ụbọchị Tọzde. Ọ bụ eziokwu na Emelumba akpọghị onye ọbụla aha, mana ụfọdụ ihe o kwuru rụtụrụ aka onye ọ na-ekwu maka ya. Lee ụfọdụ Ihe Emelumba kwuru nke nwere ike igosi onye ọ na-ebo ebubo a: Ọ bụ otu Gọvanọ chịburu Imo steeti haziri ndị wakporo ụlọmkpọrọ n'Owerri - Declan Emelumba Onye ka gọọmentị Imo steeti na-ebo ebubo maka mwakpo a na-eme n'Owerri? Ọ bụrụ na i lechaa nkọwa ndị a anya, ị ga-eji uche mara onye Emelumba na-ekwu maka ya, maka na a tụọ ilu nkịrịka nkata, onye agwara amarala onwe ya. Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Emelumba, o kwuru na ya kwuru ihe ndị ahụ n'eziokwu. O kwukwara na ya ga-akpọghachi anyị azụ ka o tiwaara anyị akụ oyibo nsugbe. Emelumba na Uzodinma na-ekwu otu ihe Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma Cheta na Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwukwara ihe yitere nke a Emelumba kwuru. Uzodinma gwara ndị ntaakụkọ Channels na ọ bụghị ndị otu IPOB na-eme mwakpo ahụ dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ si ekwu. ""Anyị ma ndị na-akwado ndị ekperima ka ha na-awakpo Imo steeti,"" Uzodinma na-ekwu. ""Anyị ma ebe ha nọ mee ya bụ nzukọ nakwa etu ha si mee ya."" ""Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a na-esi n'ebe dị icheiche akpọbata ndị ekperima ka ha na-awakpo steeti anyị."" Mana Uzodinma akpọghị onye ọbụla aha, kama o kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu, ""obere oge, ihe niile ga-apụta ihe""." egwuregwu-43525076,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43525076,Rohr: Igbagbu Poland apụtaghị ịbụ ọkaibe,Rohr kwuru na ọ bụ sọọsọ na Naịjiria agara n'ihu itinye uchu na ihaziharị egwuregwu bọọlụ ka ha ga-enweta ezi uru pụrụ iche na'asọmpi iko mba ụwa.,"Naịjiria gbara Poland otu ọkpụ asataghị ihe Naijiria nyere mba Polond otu ọkpu asataghị ihe na egwuregwu enyi na enyi ha gbara na Poland abalị Fraide. Onye nchịkọta otu Super Eagles Naijiria kwuru na ọ bụghị imeri otu egwueregwu abụọ sọ na ịrị kachasi mara agba bọọlụ d(dịka FIFA jiri gụọ ya) bụ na Naịjiria ga-abụ ọkaibe na ikọ mba ụwa. Rohr onye kwuru na ọ bụ ụmeala na ịrụsi ọrụ ike nke ndị otu egwureegwu Naịjiria mere ha ji merie, dụrụ ha ọdụ ka ha ga n'ihu idi umeala ma rụsie ọrụ ike. Ọ bụ Victor Moses bụ onye jị penaliti nye gool n' asọmpi ahụ." afirika-56225693,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56225693,Ada Jesus Comedy: Ọrịa m na-arịa abụghị maka Odumeje maọbụ Pericoma,"Nwa ada Mmesoma Mercy Obi, onye e ji Ada Jesus mara, bụ onye ọkpa ọchị na soshal midia.","Ya bụ nwa ada nọ na nnukwu ọrịa ugbu, mana ọtụtụ kwenyere na ọrịa a bụ maka mkparị ọ kparịrị ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia. Ihe na-ewu na'ebe niile bụ na ọ bụ ihe o kwutere n'ọnụ na-arịa ya. BBC Igbo gbara Ada Jesus Comedy (Mercy Ada Jesus) ajụjụ ọnụ n'akwa ọrịa ya. Leekwa ihe ọ sara anyị maka ya bụ ọrịa na ebubo sọ ya n'azụ. Kirie ya." 49058483,https://www.bbc.com/igbo/49058483,"Building collapse: Ụlọ adaala n'Abraka, Delta steeti",Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya ekwuola na ụlọ oriri na nkwarị adaala n'Abraka nke dị n'okpuruọchịchị Ethiope East na Delta steeti.,"Onovwakpoyeya kwuru na ha amabeghị ma ya bụ ụlọ ọ dagburu mmadụ mana akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ na-ekwu na ihe ruru mmadụ anọ nwụrụ, ebe a na-atụegwu na ụfọdụ tọro n'ime ya. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwụ na ya bụ ụlọ akpọrọ 206 Hotel dị na Aghwana Avenue n'Abraka. Ndị uweojii na-ekwu na ha amabeghị ihe kwaturu ụlọ ahụ mana ihe a ma bụ na mmiri na-ezọ ebeebe kemgbe mgbe Frịada. Echekwara na mmadụ anọ bịara ọrụ n'isiụtụtụ Satọde tọrọ na ya bụ ụlọ bụ ndị nke eche na ha anwụọla ụgbụa. Lee ihe nkiri ga-amasị gị Ụmụ nwoke na-enye m nsogbu mana adịghị ege ha ntị - Agbọghọ na-ere Abacha Akụkọ ga-amasị gi" afirika-51159849,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51159849,Children of Biafra: Ihe ndị etobeghi ntoroọbịa hụrụ oge agha,Ọ bụ ụmuaka na ụmụnwaanyị ka agha na-akacha emetụta.,Ọtụtụ ndị bụ ụmụaka n'oge agha ka na-echeta ihe ha hụrụ n'oge agha. Lee akụkọ ụfọdụ n'ime ha. Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimamaka Ihenacho Akụkọ ga-amasị gị: afirika-48828911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48828911,Police attack: Ndị omekome gburu nwaanyị dị ime onye uweojii na Bayelsa,Onyeisi ndị uweojii bụ Adamu Mohammed ezipula ndị otu ya ha ka ha chọpụta ndị wakporo ụlọ rụ ndị uweojii n'obodo Agudama Ekpetima dị na Bayelsa steeti.,"Ndị uweojii sị na ndị ojiegbe wakporo ụloọrụ ahụ n'ụtụtụ taa bụ abalị nke mbụ nke ọnwa Jụlaị 2019. Mwakpo a, dịka ndị uweojii si kwuo, tara isi otu onye uweojii aha ya bụ Ola Rosanla na ndị uweojii ato ọzọ. Ha sịkwa na mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ. Maazị Mohammed nyere iwu ka ezipu ndị uweojii si na ngalana nyocha pụrụiche akpọrọ ""IGP-Intelligence Response Unit"" (IRT) na ndị ọzọ si na ngalaba ""Forensic and Homicide"" nke FCID nakwa nke uweojii ndi mmiri. Akụkọ kọrọ na nwaanyị dị ime onye ụweojii so na ndị egburu na ya bụ nwakpo." afirika-51346152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51346152,Etu mmadụ 20 si nwụọ ebe a na-azọ otite mmanụ nsọ,"Ihe ruru mmadụ iri abụọ nwụrụ ebe iri na isii merụrụ ahụ n'ụbọchị Satọde 1, Febụwarị 2020 n'oge ofufe Kraịst n'ogboegwuregwu dị na mpaghara ugwu Tanzanịa.","Ndị a nwuru ebe ha na-azọ onye ga-ebu ụzọ nata otite mmanụ nsọ a kpọrọ ""Blessed oil"" dịka onye ọrụ gọọmentị si kwuo. Nke a mere mgbe onyeisi nchụaja bụ Pastọ Boniface Mwamposa nke ụlọụka 'Arise and Shine Ministry Tanzania' wụpụrụ mmanụ ọ kpọrọ mmanụ nsọ n'ala. Mmanụ a nke ọ sị ga-agwọ imirikitimi ọrịa, mere igwe mmadụ jiri sọkọta isi na-azọ onye ga-ebuzọ rụrụ mmanụ nsọ a. Igwe mmadụ a ji ụkwụ zọgbuo mmadụ iri abụọ n'ime ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ. Anya hụrụ ka o si mee gwara ndị ntaakụkọ AFP na ọ dịka ebe a tụpụrụ nkịta ọkpụkpụ n'ala. Ọ sị na ndị mmadụ zọrọ onwe ha ụkwụ na-enweghi obi ebere, na e nwekwara ndị ji mpi aka na-akpọ onwe ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49534005,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49534005,PRODA Enugu state ekwela nkwa ịrụpụta mkpịsị odee nde 15 kwa afọ - PRODA Enugwu,"Gọọmentị etiti Naijiria esila n'ọnụ ndị isioche na-achịkọba ụlọọrụ nka na ụzụ dị n'Enugwu bụ Projects Development Institute (PRODA), wee kwuputa na ha ebutechaala ngwaọrụ ha ga-eji malite imepụta mkpịsị odee ga-akarị nde 15 kwa afọ.","Onye isi ndị bọọdụ PRODA bụ Mazi Daniel Donald Onjeh, kwuputara nke a oge ya na ndị otu ya bịara na PRODA Enugwu ile ka e si eguzobe igwe e ji arụ ọrụ nakwa ịhụ ka ndị ọrụ mere. Onjeh kwuru na PRODA malite ime mkpịsị 2B na HB, Naijiria ga-esonye na mba ndị na-arụpụta 'pencil' na mpaghara ndịda-anyanwụ Afrịka. O kwuru na ọ bụ ụmụafọ Naijiria ga-arụ ha niile, mGọọana kwuo na ha nwetara enyemaka ngwaọrụ nakwa ka e si arụ ya n'aka ndị ọkachamara na mba China. N'ihi nke a, a dọnyela akụrụngwa mmepụta mkpịsị 21 na PRODA ebe ọ na-echezi mmalite ọrụ oge na-adịghị anya. Ndị isi oche ahụ na onye direktọ PRODA Enugwu bụ Dkt. Charles Agulanna, nakwa ndị isi ndị ọzọ tinyekwara ọnụ wee gụpụta ihe ndị ọzọ ndị PRODA na-arụpụta. Ha kwukwara na ha nwere olileanya ịrụpụta ihe ndị dịka 'Lithium Battery', unyi anaghị ewepụta anwụrụ ọkụ, seramiks, ngwaọrụ na-esi n'akpụ emepụta garri, 'turbine' na-eji mmiri enye ụlọọrụ maọbụ ụlọ mmadụ ọkụ, ụgbọala nakwa ihe dị iche iche. Cheta na minista na ahụ maka sayensị na teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu, kwuburu afọ anọ gara aga na ya bụ mkpịsị odee bụ nke ndị PRODA ga-ebido ịrụpụta. Onjeh na onwe ya kwuru na ya bụ nkwa gọọmentị etiti kwere ga-abịa na mmezu oge adịghị anya. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: SON: Anyị na-amachị ngwa ahịa adigboroja kwa ụbọchị" afirika-44020802,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44020802,Adeboye: Naijiria ga-ekewa ma ogbugbu mmadụ ga n'ihu',Onyeisi Redeemed Christian Church of Christ bụ Pastọ Enoch Adeboye ekwuola na Naijiria ga-ekewa ma ọ bụrụ na gọọmentị ala Naijiria emeghị ihe maka oke ọgbụgbụ mmadụ na-eme n'akụkụ dị icheiche n'ala anyị ugbua.,"Adeboye: Onye otu kraisti ọbụla e gburu bụ nwa m nwoke maọbụ nwam nwaanyị Adeboye onye kwuru nke a n'ọgbakọ Mụọ Nsọ nke ọnwa Mee nke ndị ụka ya mere na ngwụcha izu, kwuru na ikekwa, ´ọ bụrụ na ọgbụgbụ akwụsịghị, agaghị e nwe ntuliaka na 2019"". Ọ dọrọ gọọmentị Naijiria aka na ntị ka ọ mee ngwangwa kwụsị ọgbụgbụ mmadụ maka ọkpụkperechi nke na-eme n'akụkụ dị icheiche. Dịka o siri kwuo, emeghị otu a, Naijiria ga-agbasa. Adeboye tụrụ arịrị maka ogbugbu ndị ọchịehi gburu ụkọchụkwụ Katolik abụọ na ndị ụka ruru iri na asaa na Benue na nsonso, sị na dịka ndị otu Kraisti na Naijiria na-akpọ ya 'nna' na onye otu kraistị ọbụla e gburu bụ 'nwa' nwoke maọbụ nwaanyị. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46008207,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46008207,Ụlọọrụ onyeisiala akatọọla PDP maka ikwu na Buhari ga-egosirịrị asambodo ya,Akụkọ ndị dị mkpa taa,"Ụlọọrụ gọmentị etiti ekwuola uche ha maka asambodo Buhari A na-ebo Onyeisiala Muhammadu Buhari na o gosighị asambodo ya were bata n'ọchịchị na 2015 Ụlọọrụ onyeisiala agwala ndị na-esi onwu maka iwepụta asambodo Muhammadụ Buhari ha ga gbara ọgwụ ha ṅụọ. Odeakwụkwọ mgbasa ozi Onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina kpọrọ ndị na-eme otu ndị ọnọnkịtị enwe efe. ACF asaala Nnamdị Kanu Nnamdị Kanu pụtara ihe ọzo na onwa Ọktoba ka ọ na-ekpe ekpere na mba Izrel Ndị otu Arewa Consulative Forum echerela Nnamdị Kanu bụ onye ndu Ipob aka mgba maka okwu ọ tụpụrụ ha na okwu mbụ ya kemgbe ọ pụtara ihe. Onyeisi otu ahụ bu Yerima Shettima kwụrụ na okwu Kanu maka ịkewe Naịjirịa bụ mba a na-abara agụ. Ndị an-eme ncheta ndị egburu na Pittsburgh N'ofesi, akpọpụtala aha ndị egburu na nwakpo ahụ emere na ụlọnzụkọ nke Pittsburgh na mba Amerika. Ụmụnwanne abụọ na di na nwunye so na ndị isi ha alara na ya bụ nwakpọ nke mmadụ iri na otu (11) nwụnyụrụ anya pii. Chelsea ji ọkpụ anọ zuo Burnley ike n'ahụ tata Chelsea meriri ndị Burnley ọkpụ 4 - 0 N'egwuruegwu, Chelsea ewerela ọkpụ anọ a asataghị otu duo ndị Burnley ụlọ na-egwuruegwu ha gbara tata. N'otuaka ahụ, Crystal palace na Arsenal ji ọkpụ abụọ gbaa onwe ha onye naba onye naba. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Họpụtanụ ndị ndu gụrụ akwụkwọ - Sanusi Onye Emir nke Kano bụ Muhammed Sanusi n'ime emume mpụta n'ụlọakwụkwọ nke Mahadum Nile dị na Naịjirịa bụ nke e mere ụnyaahụ kwuru na ọtụtụ ndị ndu Naịjirịa bụ ndị na-agụghị akwụkwọ. O Kwuru ka ndị Naịjirịa saa anya ha na mmiri n'ịhọpụta ndị ndu gụrụ akwụkwọ ma mara uru dị n'agụmakwụkwọ. Ndị iro m chọrọ igbu m - Nwoye Ben Nwoye, onyeisi ndị APC n'Enugwu Onyeisioche Pati APC n'Enugu Steeti bụ Ben Nwoye a gbanarịla ọnwụ ya dịka ndị oji egbe wakporo ụlọ ya dị n'Independent Layout nke Enugwu Steeti. Nwoye kwuru na ndị a wakporo ndị uweojii na-echekwa ụlọ nche ya ma merụọ otu onye n'ime ha ahụ bụkwanụ onye na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. N'ofesi A gbagbuola mmadụ iri na otu n'ụlọ nzukọ a kpọrọ 'Tree of Life' dị na Pittsburgh nke Pennsylvania mba Amerịka dịka ha na-eme ofufe nroh. Onye a na-eche mere nke a bụ otu nwoke a kpọrọ Robert Bowers dị afọ iri anọ na isii bụkwanụ onye nọ n'aka ndị uweojii ugbua. N'egwuregwu Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ. Cheta na Leicester City bụ ebe Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a a na-eme. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Tony Elumelu tinyere N1.8m n'ahịa akị oyibo m - Chigozie" 42789071,https://www.bbc.com/igbo/42789071,Rochas Okorocha: 'Ndị asịrị kpachara anya ha!',"Gọvanọ na-achị Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onweghị ala ya ga amaputa maka ndị Fulani na achị ehi n'Imo Steeti. Okwuru nke a unyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị Jenụwarị iri abụọ na atọ n'ọwerri, isi obodo Imo Steeti.","Ọtụtụ ndị Imo Steeti akwadoghị ị nye ndị Fulani na-achụ ehi ala Okwuru nke a site n'onu komishiona na-ahụ maka mgbasa ozi bụ ọkammụta Nnamdị Obiaraeri. Ozi ahụ kwuru na onweghị mgbe Gọvanọ Rochas jiri chee echichi ị nye onye ọbụla ala ndị Imo steeti. O kwukwara na-asịrị niile ana anụ maka ịnye ndị Fulani na-achị ehị ala ndị Imo Steeti bụ ọrụaka ndị iro nakwa ndị mgbam na ndị ntụ. Akwụkwọ akụkọ ekwubuola na Gọvanọ Okorocha sị na ya ga-enye ndị na achị ehị ala n'Imo Steeti nke ọtụtụ ndị Igbo katọrọ na ezoghị ọnụ. BBC Igbo gbara mbọ I kwuru Oje ozi Rochas maka mgbasa ozi mana nwaamadị ahụ bawara BBC mba gbanuọ ekwenti ya. Ka ọdị ugbua, ndị Gọvanọ ndị ọzo n'ala ịgbo ekwuola na ha agaghị amapụta ala ọbụla maka ị nye ndị Fulanị na-achị ehị. Ohaneze Ndị Igbo akabichiela na onweghị onye ga enye ala ndị Igbo maka ịchị ehi. Na River Steeti, Gọvanọ Nyesom Wike ekwuola na ya nweghị ala ya ji arụ ọrụ ma ya fọkwa nke ya na-enye mmadụ." afirika-50950626,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950626,Ohanaeze Ndigbo: Ọ bụ oke Ọwụwa-anyanwụ iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo,Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ bụ oke ndị Ọwụwa Anyanwụ iwepụta onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023.,"Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru nke a ka e wepụtaara ọha akwụkwọ maka ndụ Igwe Nnewi bụ Igwe Kenneth Orizu na Nnewi na nso nso. Nwodo sị na e meghị etu a bụ igosi ndị Igbo na ha esonghizi n'ihe a na-eme n'ala Naijiria. Napụnụ nwa onyeisiala akụnaụba ya - Ụlọikpe Ụlọikpe dị na mba Angola enyela iwu ka a nakọrọ Isabel Dos Santos bụ nwa nwaanyị Jose Eduardo Dos Santos onye bụbụ onyeisiala, ọbaego nakwa akụ ndị ọzọ ọ kpakọrọ. Isabel bụ onye a na-agụbu dịka 'nwaanyị kacha nwee ego na mpaghara Afrịka', bụ onye a na-ebo ebubo iso ndị kpakọrọ akụnaụba obodo ebe o ruru otu ijeri dọla. E bokwara ya ebubo ịnwa izubanye nde Yuro iri na mba Rọshịa. Ebubo a na-abịa dịka onyeisiala mba ahụ bụ Joao Lourenço na-anwa ịnapụta ego ruru otu nde dọla ọ sị na Isabel na ndị otu ji. Oge ọbụla ka ọ na-agọrọ ụkwụ na aka ya, sị na ọ maghị maka ebubo ndị a na-ebo ya ọkachasị oge nna ya nọ n'ọchịchị. Ọgụ ọ chara n'Ịran? Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Ịran esunyela ụlọọrụnnọchiteanya ndị mba Amerịka ọkụ maka iwe ogbunigwe si n'ikuku Amerịka tụpụrụ. Ha gara n'ihu kwuo na ha chọrọ ka e mechie ụlọọrụ ahụ. Rooney ọ ka na-agba bọọlụ? Ikpeazụ Wayne Rooney gbara bọolụ bụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 2019 oge ọ ka nọ DC United A na-atụ anya na deede Wayne Rooney dị afọ iri atọ na anọ ugbua, ga-agbara Derby County bọọlụ mgbe ha na Barnsley ga-ezute na Championship. Cheta na Rooney binyere aka n'akwụkwọ ịgbara ha bọọlụ ma na-etinye ọnụ na nchịkwa kemgbe Ọgọstụ. Iji 'paracetamol' esi anụ kanda nwere ike igbu mmadụ - NAFDAC Anụ kanda Nke na-ewu ugbua bụ na ụfọdụ ndị n'esi nri ahịa na-etinyezi ọgwụ paracetamọl n'anụ. Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control' (Nafdac) bụ ndị kwuru nke a. Ha kwuru na ndị mmadụ na-eme nke a ka anụ kanda ha na-esi ghee ngwa ngwa. Mana NAFDAC na-adọ aka na ntị ka ndị mmadụ hie asaa n'anya. Ha kọwara na Paracetamol na-akụrị umeji nakwa ngụngụ mmadụ ma e sie ya n'ọkụ. Lee ụzọ ị ga-eji sie kanda gị ka o ghee n'oge: Whatsapp Site n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba, ụlọọrụ Whatsapp kwuru na ihe karịrị ijeri mmadụ ise agaghịzị enwe obanzikorita ozi 'Whatsapp' n'ekwentị ha. Atụmaatụ a ga-emetụta ekwenti nwere 'Windows' nke ihe o ji arụ ọrụ nke bekee kpọrọ 'operating system' (OS) karala nka. Ekwentị ndị a gunyere Nokia Lumia bụ nke kpetere azụ n'iji Windows. Ekwenti a pụtara kamgbe afọ anọ ka na-aga ahịa ruo ugbua. iPhone na-eji iOS 8 nakwa ekwenti Android nwere sọftware 2.3.7 sokwa na ndị ga-adabanye na mmiri ọkụ a site n'ọnwa Februarị nke 2020. Kamgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa July, ndị nwere ekwenti ""Microsoft store"" anaghị ahụ WhatsApp webata n'ekwenti ha. Ụlọọrụ Whatsapp kwuru na mkpebi a hịara ha ahụ mana nke a bụ ụzọ ha si eme ka ndị mmadụ na ibe ha na-akpakọrịta ọfụma. Cheta na ha wepụrụ nkwado ha n'ebe ekwenti akpọrọ 'Blackberry' nakwa ekwenti 'Windows'. Ebelechukwu Obiano o mere alụ? Nwunye gọvanọ Anambra steeti ọ gara mba Amerịka ime ọgọ hapụ ndị Anambra? Ọnụ na-ekwuru gọvanọ steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na ọ bụ okpokpo asị. Kedụ nke bụzị eziokwu? O kwuru na gọvanọ Willie na nwunye ya bi n'obodo Houston dị na mba Amerịka tupu ọ bụrụ gọvanọ Anambra steeti. Adinuba kwuru na nkekọrịta ihe enyemaka nwunye gọvanọ mere n'obodo ahụ abụghị ihe ọhụru kama ọ bụ omenaala ha na-emekarị mgbe bi ebe ahụ nke ha agaghị akwụsị. N'okwu ya, ""ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọkata kenye ụmụ ogbenye gbara ha okiri okiri ihe""? Mana lee ihe otu nọ na soshal midia kwuru maka ya bụ atụmaatụ. @JohnFanimokun kwuru na nke a pụtara na ndị Anambra nwezuru ihe niile eji ebi ndụ dị mma. Gịnị ga-eme akwụkwọ ego n̄ọhụụ bụ 'ECO'? Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-eleba anya n'akwụkwọ ego ọhụrụ bụ nke otu ECOWAS kwekọrịtara iji na-atụ mgbere malite n'afọ 2020. Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru nke a n'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Yusuf Tanko Abdullahi. Cheta na ọbụ n'ọnwa Jun nke ka mba niile so n'otu ECOWAS nwere nkwekọrịta na ha ga-ejizi otu akwụkwọ ego a kpọrọ 'Eco' wee na-azụkọrịta ahịa. Ndị gọvanọ achọghị ka ndị agha laa Samuel Ortom bụ gọvanọ Benue Steeti achọghị ka ndị agha si na steeti ahụ pụọ. Ụfọdụ ndị gọvanọ na-arịọ gọọmentị etiti ka ha hapụgodi atụmatụ ịkpọpụ ndịagha na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa. Ndị gọvanọ a na-ekwu na nchekwa adịchabeghi mma dịka ndịagha si ekwu. Cheta na ndịagha kwuru n'ụbọchị Monde na ha ga-amalite ịdọpụta ndị otu ha n'akụkụ obodo dị iche iche. Nke a bụ iji mee ka ndị uweojii weghara ọrụ nchekwa ebe ndị ahụ. Mana gọvanọ steeti Benue, Taraba na Plateau rịọrọ ka gọọmentị ghara ịkpọpụ ndị agha n'ogbe ha. Samuel Ortom nke Benue Steeti gwara ndị ntaakụkọ Punch na ""ọtụtụ ndị steeti m ka nọcha n'ụlọ ize ndụ (IDP Camps)"". ""Anyị na-arịọ ka onyeisiala hapụ ndị agha ka ha nọrọ ruo otu afọ ọzọ."" Egwu adịghị maka ụgwọ Naịjirịa ji - Lai Mohammed Lai Mohammed kwuru na Naịjirịa ka mma ugbua n'ọchịchị Buhari Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na egwu adịghị maka ụgwọ gọọmentị Naịjirịa ji ma n'ụlọ ma na mba ofesi. Mohammed kwuru oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na Legọs. O kwuru na ụgwọ Naịjirịa ji karịrị ijeri dọla iri asatọ na atọ. Mana nke ahụ apụtaghị na ọbụ gọọmentị Buhari bitere ego ahụ niile. Nke ahụ apụtakwaghị na ụgwọ gọọmentị ji na-agbaji ya aka. Mohammed kwuru na ""ego gọọmentị na-ebite ugbua bụ iji rụọ ọrụ mmepe dị icheiche."" Onyeisi 'Nissan' agbaala ọsọ ndụ Carlos Ghosn kwuru na ọ bụ mmegbu ka ndị ọchịchị Japan na-emegbu ya. Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ ụgbọala Nissan bụ Carlos Ghosn agbaala ọsọ ndụ gbaga mba Lebanon n'ihi ebubo mpụ na nrụrụaka e boro ya. A nwụchiri Ghosn n'ọnwa Nọvemba afọ 2018 na mba Japan. Mana onweghị onye ma etu o si mịpụ gbaga Lebanon. Ghosn ekwuola ugboro ugboro na aka ya dị ọcha n-ebubo ndị ahụ a na-ebo ya. Ihu eligwe achaala ọbara ọbara na Ọstralia Ọkụ ọgbụgba mere ka ihu eluigwe gbanwee na Ọstrelịa Puku kwuru puku mmadụ na mba Ọstrelịa na-agbagazi n'akụkụ osimiri ịga zere ndụ n'ihi oke ọkụ ọgbụgba na-achụpụ ha n'ụlọ. Oke ọkụ ọgbụgba a mere ka ihu eluigwe gbanwee na-acha ọbara ọbara nke mere ka egwu jide ọtụtụ ndị mmadụ. Ekpomọkụ eruola digrii iri anọ na steeti niile dị n'Ọstrelịa ugbua. Iheanachọ alọghachila Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ ka ha (ndị Leicester City) na Fleetwood sọrọmpi maka iko FA Nwaafọ Igbo bụ Kelechi Iheanacho ekwuola na obi dị ya mma n'ihi na otu ya bụ Leicester City bụ ndị nke abụọ n'asọmpi English Premier League na-abanye afọ ọhụrụ. Iheanachọ achọtala ụkwụ bọọlụ ya na ọdị nso dịka ọ na-enyezi goolu aghara aghara mgbe ọbụla etinyere ya n'egwu. O kwuru na ha na-agbasị mbọ ike ịhụ gara n'ihu na-emeri asọmpi ha. Football: Onye ga-aga ebee na Jenụwarị Mmadụ abụọ ha apụ n'otu ha na Janụwarị a? Dịka afọ 2019 na-akụrụ ọnụ, ụzọ emegheela maka nzụta na ire ndị ọgba bọọlụ na mba dị icheiche n'ụwa. Ụfọdụ ndị a na-ele anya na ha nwere ike ịhapụ otu bọọlụ ha gunyere Paul Pogba nke Manchester United, ǹa Gareth Bale nke Real Madrid. Ndị ọzọ bụ Olivier Giroud nke Chelsea na Wilfried Zaha nke Crystal Palace. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ekeresimesi oge ọchịchị Rochas ọ ka nke Ihedioha mma?" afirika-55012482,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012482,David Umahi: Ihe ndị Ebonyi na-ekwu maka etu o si gbalaga hapu Ebonyi,"Okwu na David Umahi buzi onye otu pati ""All Progressives Congress"" (APC) bụzị akụkọ a kọrọ gafee.","Mana ụfọdụ ndị Ebonyi tinyere ọnụ na ya bụ okwu ma kwuo etu o si emetụta ha n'obi. Ebe ụfọdụ sị na gọvanọ Umahi emeteghị ya dịka ha na-ahụ Ebonyi dịka steeti PDP, ndi ọzọ na-asi na ha nabatara ya dịka ihe ga-ebutere ha ọganirụ. Gee ha ntị n'olu:" afirika-44200154,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44200154,Bob manuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa,Nwafọ Igbo ama ama n'ime ihe nkiri Nollywood bụ Bobmanuel Odogwu kwuru na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ ihe nwute.,"O kwuru nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'Enugwu. Odogwu kwuru na ndị Igbo bụ ndị mbụ na Naịjirịa, mana e bidoro na akpagbu ha ma kpagide ha n'akụkụ. O kwuru na mgbe a lụchara agha Biafra, na a naara ndị Igbo ihe niile ha nwere. Mana n'ime afọ iri anọ, ndị Igbo wee pultekwa dịka osiisi achara ma soro n'ihe niile a na-eme na Naịjirịa. Odogwu gara n'ihụ rịọ ndị Igbo ka ha nwee otu obi ma pụta n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, i ji were ezi ọnọdụ ruru ha." 42856099,https://www.bbc.com/igbo/42856099,Ladysmith Black Mambazo eriela Grammy ọzọ,Ndị otu egwu Black Mambazo nke Sawt Afịrịka nwetere ọkwa ka ndị ewu ha kachasị nkeọma na uwa niile na ngalaba ndị Grammy Awards kpọrọ 'World Music'.,"Black Mambazo enweteala Grammy ụgboro ise mbụ Black Mambazo nwetere ọkwa na Grammy Award nke enyere ụnyahụ na New Yọk na mba Amerịka. Abalị ahụ nke Bruno Mars nwekarịrị nrite Grammy. Nke mere ya ụgboro ise Black Mambazo nwetere Grammy. Ọ ha mere ka ụwa niile mata maka egwu ndị zulu a na-akpọ isicathamiya. End of Twitter post, 1 Egwu ha jiri nwete Grammy a bụ ""Shaka Zulu Revisited: 30th Anniversary Collection"". Egwu a bụ nke ha ji kwanye ndị hiwere otu ha ụgwụ. Ndị a hiwere otu a arituola. Gọọmentị Sawt Afịrịka zịpụrụ tweet ha ji kene ndị Black Mambazo." afirika-50619771,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619771,Davido enwetala echichi na Delta state,A ga-amalite ịkpọ Davido 'ichie'?,"Aha otutu a sitere n'echichi ndị Ibụzọ dị na Delta steeti chiri David Adeleke n'ụbọchị 30 nke ọnwa Nọvemba 2019 a. Otiegwu ahụ gara n'obodo Princess Pat Ajudua bụ 'Chief Whip' n'ụlọomeiwu Delta steeti ma bụrụkwa nne enyi ya nwoke, ebe ọ natara echichi ahụ. 'A ga m agbagha mmeri Adeyemi' - Dino Melaye Dino Melaye ekwuola na ọ ga-agbagha mpụtara ntuliaka e mere na mpaghara Kogi West nke Smart Adeyemi meriri n'ihi na ọ nabataghị ya. Ọ kwuru n'akara Twitter ya na mmeri eji ọgbaghara na mwakpo nweta abụghị ezi mmeri. Ọkụ agbaala ọdọ ahịa iri na ise na Legọs Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs emenyụọla ọkụ gbara n'ahịa Owode-Onirin dị na mpaghara Ikorodu. Ọkụ ahụ metụtụtara ọdọ ahịa iri na ise mana o nweghi onye mrụrụ ahụ maọbụ nwụọ na ya bụ ọdachi. Na mba ofesi Ihe ruru mmadụ iri na otu na-anata ọgwụgwọ ugbua dịka otu onye bu egbe wakporo ụlọ egwu dị na steeti New Orleans nke mba Amerịka. Ndị uweojii kọwara na ha anwụchiela otu onye ma kwuo na ha ka na-esi imi n'ala maka okwu a. Onye ga-anochị anya Quique Sanchez Flores? Otu Watford esorola nzọmụkwụ otu Arsenal nakwa Tottenham n'ịchụtu onye nkuzi ha bụ Quique Sanchez- Flores. Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ọnwa atọ ha na-achụ onye nkuzi otu bọọlụ ha. Akụko ụwa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Aisha Buhari nwere okwu maka ndị Naịjirịa Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị naanị ha ka nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari na-ata ụta maka ọnọdụ ọjọọ Naịjirịa nọ n'ime ya ugbua, na ọ bụ ndị Naịjirịa niile. N'ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Abdulrazaque Bello Barkindo zipuru, o kwuru na nke a bụ ịkọwapụta ihe Aisha gwara ndị ndọrondọrọ ọchịchị oge ya na ha zukọrọ n'ọgbakọ ndị alakụba n'izu gara aga. Kuziwenu ihe mere mgbe gboo n'ụlọakwụkwọ Sam Dede nke e ji ime ejije na Nollywood mara, adụọla ọdụ sị na ọ ga-adị mma ka ụlọakwụkwọ ndị sekọndarị nọ na Naịjirịa malitere ikuzi ihe ndị mere mgbe gboo, ka ndị na-etolite nwee ike ịghọta. Dede bụkwa onye nkuzi Theatre Arts na mahadum Pọtakọt, kwuru na agụmakwụkwọ nakwa akụkọ mgbe ochie dị mkpa maka iweta ụdịrị Afrịka anyị niile chọrọ ịhụ. N'ofesi, Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe ziri ezi na mba Briten ejirila ngwangwa malite nnyocha n'ọnọdụ mgbapụta a na-enye ndị a tụrụ nga maka ihe gbasara mwakpo oyiegwu. Nnyocha a welitere isi maka ihe mere n'akwammiri Lọndọn ebe Usman Khan nọbu n'ụlọmkpọrọ wakporo ma gbuo mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ atọ ahụ. N'egwuregwu, Onye ga-aza dike mgbe Arsenal ga-ezute Norwich? N'otu aka ahụ, Manchester United ga-achọ imere onwe ha aha n'ọgbọegwuregwu Old Trafford mgbe ha ga-ele Aston Villa ọbịa. Jonathan na-arịọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị arịrịọ Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Afrịka ejirila nwayọ nwayọ na-anapụta ọchịchị n'ike dịka etu ndị agha si ewegharabu ọchịchị n'ike. O kwuru na atụmatụ a agaghị eme ka mpaghara Afrịka dị mma, wee were ohere ahụ rịọ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ya kwụsị igbu mmadụ n'ihi na ha na-achọ ịbanye ọchịchị. Onyeisiala Namibia ga-achịrị gawa Nke a ga-abụ ugboro abụọ Hage Geingob ga-achị dịka onyeisiala nakwa nke ikpeazụ ya Hage Geingob azọtala oche ya ọzọ ịchịrị gawa n'ihu dịka onyeisiala mba Namibia nke ugboro abụọ. Ka ọ na-ekele ndị mba ya, Geingob gara n'ihu kwuo na ihe kacha eme ya obi aṅụrị bụ na awakpoghi maọbụ kwafuo ọbara onye ọbụla n'ihi ntuliaka a. N'egwuregwu, Kepukepu si mba Ịngland apụta na-akọwa na e nwereike ịchụ Quique Sanchez Flores bụ onye nchịkọta Watford ọsọ eru ala taa. Ọ bụrụ na a chụọ ya, ọ ga-abụ onye nchịkọta nke atọ a na-achụ na Premier League n'ime izu abụọ a gara aga. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: World Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ" afirika-49155747,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49155747,Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ,Mkpa mkpa Boko Haram na-akpa na Naịjirịa abụghị otu nke o ji abụ abụọ.,Linda Gordians bụ otu nwaanyị Boko Haram naghara di ya n'oge ya erughị eru. Ọ gwara BBC Igbo etu ya na ihe si eme ugbua. Cheta na taa bụ ụbọchị Mondei nke ọnwa July iri atọ mere ya afọ iri Boko Haram bidoro kpawa mkpa mkpa n'ala Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44818647,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44818647,Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: PDP Imo na Abia steeti emeela ngagharị iwe.,Akụkọ ndị dị mkpa.,"PDP Imo na Abia emeela ngagharị iwe Ndị Pati PDP nke Imo na Abia Steeti buru ngagharị iwe gaa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Steeti ha dị iche iche ụnyaahụ. Ha sị na ọ bụ maka nsogbu dị n'etiti gọvanọ Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose na ndị uweojii. Ha kọwakwara na mwakpo asị na-emere Fayose bụ mmetọ ugwu ruru ya. Gọvanọ Aminu Tambuwal etiela mkpu akwa Gọvanọ Sokoto Steeti bụ Aminu Tambuwal etiela mkpu akwa na mwakpo mere na Steeti na nso nso a ataala isi mmadụ iri atọ na itoolu. Mwakpo a mere n'ọchịchị ime obodo Rabah so n'otu n'ime mwakpo ndị merela na mpaghara ugwu nke Naịjirịa. Akụkọ Mba Ofesi Praịm Mịnịsta mba Britain bụ Theresa May kwuru na atụmatụ Brexit bụ ohere Mba Uk na Amerịka nwere iji zụkọta ahịa Mana Donald Trump ekwuola n'ụsọrọ May ji chọọ ime Brexit nwereike igbochi azụmaahịa n'etiti mba UK na Amerịka. Egwuregwu: Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gara mba Rọshịa ikiri asọmpi Iko Mbaụwa atọla n'ebe ahụ, akụkọ kwuru na ụlọọrụ ha si n'aka ha mee njem a kagburu akwụkwọ njem nlọta ha Otu ngalaba na-enyere ndị mmadụ aka na Rọshịa enyeela aka ịkpọla mmadụ iri ise ebe ihe karịrị narị abụọ ka fọrọ. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: 'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'" afirika-54680547,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54680547,"Rabiu Garba: Ihe i kwesiri ịma maka DPO a, DJ Switch, Innocent Ideh, Segalink na ndị ọzọ ji isi ghọrọ mgbọ na ngagharịiwe ahụ","Kemgbe abalị asatọ ọnwa Ọktoba afọ 2020, ngagharịiwe EndSars malitere, ụfọdụ ụmụ Naijiria atụnyela ndụ ha, ebe akụnaụba dara nde kwuru nde Naira daraala mmiri.","'Anyị achọghị ndị SARS na Fegge'- Onye uweojii Rabiu Garba Dịka onyeisiala Naijiria bu Muhammadu Buhari siri kọwaa, ngagharịiwe EndSars eriela isi mmadụ iri isii na Itoolu gụnyere ndị nkịtị, ndị uweojii na ndị agha dika ọgbaghara sochiri ya bụ ngagharịiwe. Mana n' ime ọnọdụ tigbuo- zugbo ahụ nke metụtakwara ụlọakụ, ogige ndị uweojii, ụlọntaakụkọ, ọdọ ahịa, e nwere ndị foro ntutu taa ịhụ na ọ bụ ihe e kwuru ka a na-eme na-atụghị egwu ọnwụ. DPO Rabiu Garba Rabiu Garba bụ onyeisi ogige ndị uweojii dị na Fege ,Ọnịcha Anambara steeti. Onye Yobe steeti, Garba arụọla ọrụ ọtụtụ afọ n' ala Igbo. Ndị mara ya mara dịka ezigbo mmadụ nakwa onye uweojii na-akwụba aka ya ọtọ ma na-enyekwa ikpemkwumọtọ ma okwu dapụtara n'etiti mmadụ na ibe ya. Akụkọ banyere ya chakere dịka ọgbaghara sochiri akụkọ ọgbugbu ndị na- eme ngagharịwe na Legọs. Akụkọ kwuru na ndị ntorobịa na- eme ngagharịwe kworo na- aga n' ogige ndị uweojii dị iche ise na- agba ya ọkụ ma na-emetụ kwa ndị uweojii ha kwụsịrị ahụ. Mana, dịka Ọkàiwu Justus Chris Ijeoma si depụta na Facebook, oge ha gụrụ egwu iwe rute n' ogige nke Garba, ndị òtù ya kere nkwụcha ọgụ, mana Garba gwara ha dere jụụ ma wéré ire ọma gwaa ndị ntorobịa okwu medara ha obi. Udo were chịa, a gbaghị ogige ya ọkụ, dịka a na- emebi ihe ndị uweojii. Lee ụfọdụ dike na agbara ndị ọzọ chakere n' ọgụ EndSARS: DJ Switch DJ Switch bụ onye Udi n'Enugwu steeti DJSwitch, onye ezi aha ya bụ Obianuju Udeh bụ onye na- gwọkọ egwu a ma ama nke Bekee kpọrọ ""Deejay"". Nwa ada Udi n' Enugwu steeti, so na ndị aha ha chakere na ngaghariiwe EndSARS maka ịka obi n' ihu ọgụ. E wepụ nwa afọ ahụ gụrụ akwụkwọ na mahadum ' University of Portharcourt', ụwa akaghị ịma nke bụ eziokwu na mwakpo ndị agha Naijiria wakporo ndị ntorobịa nọ na 'Lekki Toll Gate' eme ngagharịiwe ' abalị iri abụọ nke ọnwa Oktoba n' afọ 2020.(20/10/2020). Kwa ụbọchị tutu o rue ụbọchị mkpamkpa ahụ kpara, DJSwitch na-eji ekwenti ya na- egosi ụwa ihe na-eme n'ebe ha gbakọrọ site n'akara Instagram ya. O sokwa na-akọwara ndị gbakọrọ ihe ndị ntorobịa chọrọ n' aka gọọmenti iji kwụsị mkpagbu ndị uweojii. Ọ bụ na ya nụ ọrụ ọ kpọrọ one ya ka ọ nọ ụbọchị ihe mere mana nwa ada ahụ kwesiri ka ụra, na- atụghị egwu. Ọbụladị oge ndị agha bidoro bịawa ha nso, ọ kpọkuru ndị ntorobịa nọ ebe ahụ ka ha dere jụụ, nọrọ ala ghara ịkpa aghara. Ntụmadị oge mgbọ na- awụ, nwata nwaanyị a nwere obi dimkpa akwụsighị ihe ngosi ya kama ọ na- eti mkpu enyemaka ma na- ekwupụtakwa ìhe na-eme dịka ọ na-eme. Ọtụtụ ndị mmadụ mechara too ya maka inwe obi siri ike kwuru ma sete etu ndị agha si gbaa ndị na-eme ngaghariwe egbe, oge ndị ogbo ya riri mbọmbọ ọsọ. Mana ụfọdụ na- akpọrị ya maka ịgba n' anwụ ihe a chọrọ izo ezo. Innocent Chukwuma Ideh Nwaokorobịa a bụ onye na- ahazi Ihe onyonyo' film' na Nollywood ma bụrụ onye nwe ụlọ ọrụ "" Onesoulfilms'. Ideh so na ndị chị ọkụ na ngagharịiwe EndSARS na Lekki, Legọs. Nwa amadị a bụ onye gụrụ mahadum na 'University of Legos' so na ndị gosiri na Naijiria nwere mmadụ n' ụzọ pụrụ iche. Dimkpa na-agara obodo ozi, Ideh ji anya ya abụọ hụ kpọrọ kwere na 20/19/2020 na Lekki Toll Gate. O ji ụgbọala ya bụga ụlọọgwụ ọtụtụ ndị mgbọ ndị agha tụrụ ụbọchị ahụ ọdachị na- agba anyammirị dara na Lekki Toll Gate. Ọ bụghị naanị nke ahụ, Ideh napụrụ agụ ihe ọ kpụ n' ọṅụ site na igbochi ndị agboro chọrọ ịwakpo ụlọakụ, zuo ohi ma suo ya ọkụ dịka ọgbaghara dapụtara ka ọdachi 20/10/2020 mèchàrà. N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midịa, a hụrụ Ideh ka ọ na-agwa ndị ntorobịa ahụ jichaa mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ na ọ kara ya mma na ha bụrụ ụzọ gbuo ya, kama ha ịwakpo ya bụ ụlọakụ. Ọ gara n' ihu gwa ha okwu metụtara ha n' obi nke mere ka ha chịsa ọwa, hapụ ihe ha chọrọ ime. Na mkparịtaụka ya na ndị ụlọakụkọ Channels TV nwere, Ideh sị na ya amaghị ihe kàrà ya obi ịkpaa ụdị àgwà ahụ na- agbanyeghị na ndị agboro ahụ nweliri ike igbu ya. O kwuru na ihe kpalietere ya nụ na ike ihe na- eme bido n' ọdachi 20/10/2020 gwụrụ ya ma chukwaa ya ụra abalị abụọ dịka ya sorola buru ozu ndị a gbagburu nakwa ndị mgbọ tụrụ buga ha ụlọọgwu. Aisha Yesufu Aisha Yesufu, onye Agbede dị n'okpuru ọchịchị Etsako West n' Edo steeti bụ onye a ma n'ihe gbasara ịgba mbọ maka ikike dịrị onye. Yesufu so na ndị hiwere otu BringBackOurGirls( BBOG), otu tìrì mkpu pụrụ iche mere ka ụwa mata maka ntọrọ a tọrọ ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị Chiboknn' afọ 2014 Yesufu bụ onye e ji ikpu nkata n' ihu agwa eze okwu n' okwu gbasara ajọ ọchịchị na mmegbu ọha mmadụ mara. Ọ pụtara ìhè n' ụzọ pụrụ ' oge mmalite ngagharịiwe EndSARS n' Abuja dịka ọ pụtara soro duo ndị ntorobịa na- eti mkpu maka mkpagbu ndị uweojii SARS. Mana Yesuf onye togara maha wuru ewukarịa oge foto ya nke otu onye ntakụko sere ebe o weliri aka ka onye na- edu agha wuru na soshal midịa. Dịka ọtụtụ na-eto ya maka anaghị atụ egwu na ịkwụnyere ọha, mana ụfọdụ ndị mmadụ na- akpọ ya ajọ aha. Ha katọrọ ya sị na ọ na- emegide okpukpere ndị ụka Alakụba bụkwa okpukperechi nke ya. Mana Yesufu bụ azụanụka. Di ya bụ Aliu,onye akanwụtanti, e jịghị ya achị dịka ọ na- enyekwa ya ezi nkwado. Ha lụọla onwe ha afọ iri abụọ majidekwa ụmụ atọ. Falz Otiegwu Folarin Falana, bụ onye a ma dịka Falz so na otu onye a ma ama ji ọkwa dịka onye aha ya na-ada ụda were nye aka n' ọgụ EndSARS.Falz so na ndị pụtara n' ama Lekki Toll Gate mee ngagharịiwe ahụ na- eleghị ihe o ga- eri ya. O jokes akara soshal midia ya gbasaa ozi EndSARS nụzọ pụrụ iche ma kpọkọtakwa ndị mmadụ maka ngagharịiwe. Ọ kọwapụtara ihe o jirila anya ya hụ n' okwu mkpagbu ndị uweojii na- akpagbu ndị ntorobịa. Ọbụladị mgbe ụfọdụ ndị ọzọ bu ngagharịiwe ahụ kụlawara bandị azụ, Falz kwuru na, ""ịga n' ihu bụ ndụ,"" na ndị ntorobịa agaghị akwụsị iti mkpu ganye na ha enweta ihe ha chọrọ. Segalink Ezigbo aha ya bụ Segun Awosanya mana eji Segalink mara ya n'elu soshal midia. Ọ bụ ọnụ na-ekwu maka ọdịmma ọha. O teelari o ji ekwu na iwu hiwere SARS ataala nchara nke bụ na o kwesiri ịgbanwe nke taa, nke echi. Segun Awosanya na otiegwu Michael Ugochukwu Stephens eji Ruggedy baba mara bụ ndị mbụ malitere ikwupụte maka End SARS n'afọ 2017. Segalink kwadoro ndị malitere ngaghariwe End SARS nke ugbua ma na ọ katọrọ etu e si hazi ya. #EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata" afirika-56114162,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56114162,Orlu Imo State: Kedụ ihe na-eme n'Orlu ugbua?,"N'agbanyeghi kepukepu na-efegharị na soshal midia gbasara Orlu, ndị bi ebe ahụ na-ekwu na ha anụbeghị maọbụ hụ ihe ọbụla.","Etu Orlu dị n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18, 2021 Onyonyo na-agbasa na Twitter nke na-egosi ebe ụgbọelu helịkọpta na-efegharị; ọtụtụ na-ekwu na ụgbọelu ahụ na-akwa mgbọ. Odz Chioma onye bi na Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe ọbụla gbara gharịị na-eme. O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu. Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu Onye ọzọkwa kwuru na mpaghara Orlu ebe o bi enweghị nsogbu ọbụla. Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ụgbọelu Hhelịkọpta na-efegharị, ndị agha nọkwa n'ụzọ mana ha anụbeghị ụdaegbe ọbụla. Rochas Okorocha agaala Orlu sị ha ka 'Ọzọemena!' Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri. Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara. O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ. O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu. Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara. N'ọnụ ya ""Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"" Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu. Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta. Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ. Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara? BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua. Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ. Ka o si gaa n'Orlu n'ụbọchị nke atọ Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu. Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi. Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a: Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe. O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata. Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi. O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara Orlu Crisis: ""Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"" Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha. Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua. BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi. Lee mmadụ ole nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Orlu ụnyahụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ. O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ . Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua. Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua. Ma ndị ọrụ aka apụtaghị ọrụ taa dịka anyị si chọpụta Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a. Lee ihe Nnamdi Kanu kwuru maka ihe na-eme n'Orlu Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na ""Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ"". O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu. O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na ""Hague"". Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands. ""Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a"" - Hope Uzodimma Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ. Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ. Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara. O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a. Ebe ndị mmachi a metụtara bụ Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ. Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ. O kwuru sị ""ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa. O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ. O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme. Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu. Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya. Kedụ etu ọgbaghara a si bido? Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu. Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé. Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep. Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ. Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka. Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ. Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere. Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere. Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ. Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ." afirika-45293495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45293495,Kedụ ego ole Naịjirịa reterela na mmanụ agbidi?,Naịjirịa eretela ihe karịrị ijeri dọlla 26 ($26bn) nke pụtara tarị naịra 7.93 (N7.93 tn) n'ọnwa asaa nke mere ya mba nke isii kachasị enweta ego na mmanụ n'otu mba na-ere mmanụ a kpọrọ 'Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC) na bekee.,"Naịjirịa nwetara pasent 6.24 n'ime ijeri dọla 417 nke pụtara tarị naịra 127.2 ego otu OPEC retara na mmanụ agbịdị n'ọnwa asaa. Angola sochiri Naịjirịa n'Afrịka dịka ha nwetara ijeri dọla iri abụọ na otu, nke pụtara tarị naịra isii na ọma (6.41). Ihe ndị a dị n'ozi ka ihe si kwụrụ n'otu OPEC nke sị n'aka ngalaba Amerịka na-ewepụta ozi banyere okwu mmanụ a kpọrọ 'US Energy Information Administration (EIA). N'ozi ahụ, mba Saudi Arabia nwetara ego kachasị n'ire mmanụ dịka ego ha ruru ijeri dọla otu narị na iri abụọ na isii (126) nke pụtarea tarị naịra iri atọ na asatọ na ọma (38.4). N'aka nke ọzọ, mba Ekwitorial Gini na Ekụadọ nwetara ego pekarịchara mpe. A na-ele anya na site n'ọnwa ọctọba, mmanụ Naịjirịa na-ebupụ ga-agbalite rụọ kago iri atọ na asatọ dịka a na-ele anya i na-ebupu ite mmanụ agbịdị (barrel) nde 1.12 (1.12 million.). Akụkọ ga-amasị gị:" 42908213,https://www.bbc.com/igbo/42908213,Ụlọikpe akwadola ndị sineti na ọjụjụ Magu,Ulọikpe ukwuu dị na Abuja ekwetala na ndị sinetị Naijiria mere ọfụma ijụ Ibrahim Magu dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka agha a kpọrọ EFCC.,"Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC Onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari họpụtara Magu ịbụ onyeisi EFCC ugboro abụọ mana ndị sineti jụrụ ya ugboro abụọ. Dịka nkachi a si ga, ọkaikpe ukwu a kpọrọ John Tsoho kachiri na EFCC echeghị ọfụma mgbe ha na-eche na ndi sineti ga nabatarịrị nanị onye ndị isi ọchịchị họpụtara. Tsoho kwuru na sineti nwere ikike i mgba mbọ hụ na sọsọ ndị tozuru etozu ka a ga họpụta maka ọrụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka na Naijirịa." afirika-47791949,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47791949,"Imo Elections: ""Aga m agbaghara APC mmehie ha megidere m na ntuliaka 2019""",Ọ gwara BBC n'ekwentị na ihe na-esere ya na otu APC bụ na ha nyere onye ọzọ ikike ịzọ ọkwa Gọvanọ.,"Nwosu kwukwara na ọ gaghị ahapụ otu ya banye otu ọzọ n'ihi na APC nwere onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha ha. Ọ sị ""anọ m n'otu ebe m zọrọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka gara aga"". Ọ dọrọ ndị nso ya aka na ntị sị ha na obi adala ha mba n'ihi na ọ ga-agbagha mpụtara ntuliaka e mere n'Imo. ""Nkwa m na-ekwe ha ndị na-eso m bụ na oge adịghị anya, anyị ga-enweta ọchịchị ruru anyị n'ihi na ọ bụ chineke na-enye ọchịchị"" O kwukwara na mmeri Emeka Ihedioha megidere iwu Naijira nke dị n'akwụkwọ iwu." 45352936,https://www.bbc.com/igbo/45352936,CBN adaala MTN nha ọzọ,"Ụlọakụ etiti nke a kpọrọ Central Bank (CBN) na Bekee, dara ụlọọrụ ekwentị si mba Saụt Afrịka bụ MTN nha maka ibupu ijeri dọla 8.134 bụ ego ha na-ekwu ha bupuru na Naijiria n'ụzọ megidere iwu Naijiria.","Dịka akwụkwọ akụkọ Thisday siri kwuo, CBN mere nyocha ihe a MTN mere kemgbe afọ itoolu gara aga, ma gaa n'ihu degara ngalaba ụlọọrụ ahụ nke nọ Naijiria akwụkwọ na-ekwu ka ha kwụghachi ijeri dọla 8.134 na egbughị oge. CBN dakwara ụlọakụ anọ MTN siri n'aka ha bupụ ego ndị a ahụ site n'afọ 2007 rue 2015 nha ma gwa ha ka ha kwụghachi ijeri dọla 8.134. Ụlọakụ anọ ndị ahụ bụ Stanbic IBTC Bank Limited, Citibank Nigeria Limited, Standard Chartered Bank, na Diamond Bank. Cheta na n'afọ atọ gara aga, a dara MTN nha ijeri naira 333 maka ịhapụ igbubi akara ekwenti ndị e debanyeghị aha ha n'akwụkwọ. MTN akwụọla ijeri N165 n'ime ego ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45417835,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45417835,Ndị ọrụ ntaakụkọ n'Abia steeti akwala arịrị,Akụkọ kachasị mkpa taa:,"Ngagharịiwe ndị ntaakụkọ n'Abia Steeti Otu ndị ụlọọrụ mgbasa ozi nke gọọmentị Abia steeti bụ Broadcasting Corporation of Abia State (BCA) enwetela ọsịsa n'aka gọọmenti Abia site na ngagharịiwe ha mere maka nchabi ụgwọ ọrụ ha. Ndị ụlọọrụ ahụ kwuru na gọọmenti Abia steeti malitere ịchabi ụgwọọnwa ndị ọrụ ha kamgbe ọnwa Julaị afọ 2015. Onyeisioche otu jikọtara ndị ọrụ ahụ bụ Nji Joseph kwuru na gọọmentị ekwela nkwa ikwuzu ụgwọ ọnwa ha malite na nke ọnwa Ọgọstụ. Ndị uweojii anwụchiela onye gbara akaebe ụgha Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria Ndị uweojii agbala otu nwoke bụ Ismail Yakubu n'anwụ maka ịgba akaebe ụgha megide Edwin Clark nke mere ha ji wakpoo ụlọ ya dị n'Abuja. Yakubu kwuru na onweghi ihe ọjọ o mere, na ọ bụ kepukepu ọ nụrụ ka ọ gwara ndị uweojii. Na mba ọzọ Mmadụ atọ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ anwụọla ebe ha na-agbanyụ ọkụ na-ere n'ụlọ ogologo dị na Johannesburg na mba Saụt Afrịka. Otu onye si n'elu daa ma nwụọ, ebe abụọ ndị ọzọ nwụrụ n'ime ụlọ ahụ. N'egwuregwu, Ndị nchịkọta otu egwurewgwu bọọlụ na Yorupe akpọọla oku ka akachapụ iwu na-asị na inye goolụ n'ọgbọ ndị ọzọ dị mkpa nke akpọrọ 'Away goal' na bekee. Ha kwuru na iwu a na-eme ka otu egwuregwu bọọlụ na-akpachị ọgbọ ha ma ghara ịgba ezigbo bọọlụ. Gere nkeji nke taa: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa: Onye ọkaiwu ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Ugo Egbujo ekwuola na e nwere ụzọ kacha mma Ndigbo inweta Biafra ha na-achọ na-alụghị ọgụ ọbụla. 'Restructuring' ka mma karịa referadum" afirika-56147704,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56147704,Imo State: Ndị niile Rochas Okorocha nyere ala na Ekwema Crescent gba aka,Gọọmentị Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-anapụta aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha ala nakwa akụnụba niile o ji aka ike weghara oge ọ nọ n'ọchịchị.,"Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na nke a ihe ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ndị isi gọọmentị nwere n'Imo steeti n'ụbọchị Tọzde. End of Twitter post, 1 Gọvanọ Uzodinma kwuru na ụlọikpe enyela ha ikike ijichi ihe gọọmentị niile Okorocha weghaara n'ụzọ ezighị ezi. Lee ọkpụrụkpụ ihe Uzodinma kwuru na ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ahụ: Ụlọikpe enyeala iwu ka e jichie ụfọdụ akụnụba Rochas Okorocha Ụlọikpe ukwu dị n'Owerri enyela iwu ka e jichie nwa mgbe nta ụfọdụ akụnụba bụ nke gọọmentị Imo steeti na-ebo ebubo na aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha nwetara n'ụzọ n'ezighi ezi n'iwu. Ọkaikpe Fred Njemanze nyere iwu a n'ụbọchị Tọzde dịka o kpebiri ikpe gbasara akwụkwọ gọọmentị Imo steeti gbara Rochas Okorocha site n'aka ọkaiwu Louis Alozie. Mkpebi a ọkaikpe Njemanze nyere bụ ụdị nke bekee kpọrọ 'ex-parte order', nke pụtara na onweghị ọkaiwu Rochas Okorocha nọ ebe ahụ ikwuchitere ya ọnụ ya oge e kpebiri ya bụ ikpe. Mana ọkaikpe Njemanze nyere ohere ụbọchị olemole ka onye nwe akụnụba ndị ahụ bịa kọwaa onwe ya, emeghị otu a, gọọmentị Imo ga-eweghara ha kpam kpam. Dịka ụlọntaakụkọ Channels na The Cable si dee, akụnụba ndị ahụ gụnyere ala nakwa ụlọ dị na mpaghara dị icheiche n'Imo steeti, nke gọọmentị kwuru na Okorocha ji aka ike nakwa ụzọ nrụrụaka weghara ha oge ọ bụ gọvanọ. Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na o nweghị aka na nsogbu dakwasara Rochas Okorocha mgbe ya na ndị otu ya gara n'ụlọ gọọmenti machiri. O kwuru nke a mgbe ọ gara ikele onyeisiala Muhammdu Buhari maka nkwado o nyere ya na mbọ ọ na-agba iji weta udo n'obodo ọrlu dị na steeti ya ebe enwere ọgbaghara nso nso a. Uzodimma kwuru na ọ bụ n'ọchịchị Ihedioha ka e hibere ọgbakọ ndị ọrụ ụlọikpe na steeti ya bidoro inyocha ebubo gbasara ala a nara ndị mmadụ n'ike ma nke e kwuru na ndị mmadụ were ala gọọmenti mere nke ha. O kwuru na ka ndị ọrụ ụlọikpe ahụ nwechara nzụkọ, ha kwetere ka amachie ụfọdụ ụlọ arụrụ n'ala ndị a a na-ekwu maka ya, nke ma gọọmenti Imo steeti kwenyere na ya. O kwuru na ọ bụ ndị ngalaba ọ bụ ọrụ ha imachi ụlọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ha. ""Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ahụ mma ya ga ụlọikpe makana ihe gbasara ọchịchị abụghị ihe e ji egwu egwu."" Iwu obodo agaghị agbanwe maka onye ọbụla - Gọọmentị Imo steeti Gọọmentị Imo steeti esila n'ọnụ Enyinnaya Onuegbu na-elekọta ala na steeti ahụ zaghachi ebubo nke onye bụbu Govanọ bụ Rochas Okorocha boro ha. Onuegbu kwuru na iwu obodo bụ iwu obodo nke agaghị agbanwe maka onye ọbụla nakwa na ihe dị ya mkpa bụ ọdịmma ndị Imo niile. Ọ gbara ama nke na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere iji nụ olu ya maka nwuchi anwụchiri Okorocha. ""O rụọla otu izuụka kemgbe anyị gbachiri ụlọoriri ahụ tupu Okorocha na ndị otu ya abịa gbaka ụzọ ebe ahụ"" ka o kwuru. Lee ihe o kwuru n'uju ebe a Hope Uzodimma echezọọla etu o si bata APC - Rochas Okorocha Rochas Okorocha bụbu aka na-achị Imo steeti ekwuola na onye nọ n'ọkwa ahụ ugbua bụ Hope Uzodmimma echezọọla ka o si bata otu APC O kwuru nke a dịka ya na BBC Igbo na-enwe mkparịtaụka n'ekwentị gbasara nwụchi anwụchiri ya n'Imo steeti ụnyaahụ. Ọ kọwara sị na ọ bụ ndị ụweojii nke Gọvanọ onwe ya ji aka ya hazi na ndị akpụ obi bụ ndị lụsoro ndị nke ya ọgụ ma gbaa ha egbe ma kụwaa ha isi. Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na mkparịtaụka ahụ. ""Ihe a abụghị ihe m tụrụ anya ga-eme m"" Ndị uweojii kwụ ebe ahụ gbachị nkịtị dịka ihe a niile na-eme ma mechaa kpọzịa ndị uweojii ọzọ ha bịa nwụchie m. Ihe kachasị tụ m n'anya bụ na ndị uweojii kwụ ebe ahụ ka ihe ndị a na-eme. Ọ bụghị eziokwu na o ji ego gọọmentị rụ ụlọoriri ahụ, Ha eburu la okwu a gaa EFCC na ebe ndị ọzọ Mgbe Uzodimma hụrụ na o nweghi isi, ọ tụgharịa sị na ebe arụrụ ụlọ abụghị ebe kwesiri. A bụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ n'Imo steeti"" ka o kwuru gbasasra ebubo na o ji ego gọọmenti rụọ ebe dị icheiche na steeti ahụ. ""Ihe ndị a niile bụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'enweghi isi na ọdụ"" ka o kwuru. Ihe a bụ aghụghọ Uzodimma na-eme mgbe niile. Ọ mehie n'ụzọ ọbụla, o jiri ụlọikpe kpuchie onwe ya. Ọ bụrụ na e nwereike ị me mụnwa bụ Rochas ụdịrị ihe a. Kekwanụ maka ndị ọzọ?"" ka o kwuru na ngwụcha. Mmadụ asụkapụla n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ndi otu ya ikpe Ndị mmadụ na-eche n'Owerri Magistrate court dịka ndị uweojii na-akwado ịkpọpụta Rochas Okorocha n'ihu ọha. BBC Igbo ga na-ewetere ụnụ etu ihe si aga ebe ahụ. Mmadụ iri na ise ka ụlọikpe ahụ kpọpụtara ima ikpe. Aha ha gụnyere, Chief Uche Nwosu, Lasbrey OkaforAnyanwu, Uzoma Anwuka, Ijeoma Igboanusi na ndị ọzọ. Ihe mere eji nwụchie ma kpọpụta ndị a bụ maka etu ha si wụbata n'ụlọ 'Royal Spring Palm Hotel' gọọmenti machịrị nke iwu megidere. Ndị niile ahụ kwụrụ na o nweghị ihe ọjọ ha mere. Onye ntakụkọ anyị kwụrụ ahụghị Rochas Okorocha n'ụlọikpe ahụ nke eji akpọpụta aha ha na ndị a ga-ama ikpe. Anyị atọhapụla Rochas Okorocha anwụchịrị ụnyahụ n'Imo steeti- Uweojii Imo steeti Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha tọhapụrụ aka chiburu Imo state bụ Rochas Okorocha ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụnyahụ. Ikeokwu gwara ndị ntaakụkọ channels nke a mgbe a na-agba ya ajụjụ n'onyonyo ha n'ụtụtụ taa bụ Februwarị 22, 2021. O kwuru na ya ndị otu ya ka na-eme nyocha ịmata ka okwu ahụ si malite na ihe merenụ. Ikeokwu kwuru na onye ọbụla ikpe mara ga-aga ụlọikpe zara ọnụ ya. Ihe anya m hụrụ na Royal Palm Hotel ụnyahụ riri m ọnụ n'Imo state- Rochas Okorocha Rochas Okorocha: Etu ndị uweojii Imo ateeti si memina mụ na ndị otu m Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha akọwaala etu ndị uweojii nọ n'Imo steeti si memina ya ndị otu ya ụnyahụ. O kwuru na ọ gara ilebanya n'etu e si amachị ụlọ oriri na nkwarị ya akpọrọ Royal Palm Hotels n'Imo steeti mana ndị akpụobi ọ hụrụ ebe ahụ bidoro mewa ya na ndị otu ya iwa. O kwuru na ndị uweojii kwụ na-elele ka ndị akpụ obi ahụ nọ na-eti ndị nke ya ihe ma mechaa gbawa egbe ma were ose anya gbaa ndị otu ya so ya bia ebe ahụ. Okorocha kwuru na ndị uweojii mechara nwuchie ya mana ọ jụrụ ndị nyere ha ikike ime ihe ndị ha na-eme ya na ndị otu mgbe ha rutere na 'Royal Palm Hotel', ha kwuru na ha bụ ndị uweojii na nọ n'ụlọ obibi gọọmenti Imo steeti. Rochas kwuru na a gbara ọgọ ya nwoke egbe nke ọ na-amaghị ma ọ ka ga-adịkwa ndụ makana ọ gbara oke ọbara. O kwuru na mgbe a kpọ ya gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii, ọ jụrụ ha ihe bụ iwu ọ dara, ndị uweojii gwara ya na ọ bụ iwu 'conspiracy' na 'Public disorder' ka ọ dara. O kwukwara na ndị uweojii gwara ya na ọbụ gọvanọ Hope Uzodimma nyere iwu ka ha nwụchie ya. Rochas Okorocha ka na-ewukwa ruo ụtụtụ a dịka ụmụ Naịjirịa ebidola kwuwe maka etu e si nwụchị ya ụnyahụ bụ Februwarị 21,2021. Ihe mere e jiri nwuchie Rochas Okorocha: Rochas Okorocha n'ogige ndị uweojii Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha. Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Rochas Okorocha ji aka ya gaa ịgbape ogige 'royal palm estate' bụ nke ọchịchị Hope Uzodinma gbachiri. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya ugboro ugboro. Mana onyonyo apụtala ebe Rochas Okorocha nọdụrụ ala n'ogige ndị uweojii mana o dobeghị anya oge e sere ya bụ onyonyo. Onyonyo na-egosi ebe Rochas Okorocha nọ n'ime ụgbọala ndị uweojii Onye enyemaka mgbasaozi Rochas Okorocha bụ Ebere Nzewuji gwakwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị uweojii ji nna ya ukwu. Nzewuji kwukwara na ndị ekperima si n'aka gọọmentị Imo steeti wakporo Okorocha oge ọ gara n'ụlọ oriri na nkwari nke nwunye ya nwe. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ekperima ahụ gbara onye uweojii na-echekwa Okorocha egbe, ma merụkwaa ụfọdụ ndị ọzọ so ya ahụ. Ihe gọọmentị Imo steeti kwuru Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti N'aka nke ọzọ, onye enyemaka mgbasa ozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Oguike Nwachukwu kwuru na ihe niile Nzewuji kwuru abụghị eziokwu. Nwachukwu kwuwu na gọọmentị kpọchiri ogige ahụ akpọchi n'ihi na ọ bụ ihe a natara n'aka onye zuru ya ezu. Mana Rochas Okorocha kpọọrọ ndị agboro ga kụpụ igodo e ji kpọchie ebe ahụ ma banye ya n'ike. Nwachukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ọrụ ndị uweojii ịhụ na ndị mmadụ rubere isi n'iwu gọọmentị. O kwukwara na ebubo Okorocha na-ebo na ọ bụ gọọmentị Imo steeti zigara ndị omekome wakporo ya na ndị otu ya bụ okwu asị. Ogige Royal Palm Estate nke nwunye Rochas Okorocha nwe, mana gọọmentị Imo steeti ewegharala ya. Cheta na gọọmentị Imo steeti kwuru na ogige 'royal palm estate' bụ ụlọ Rochas Okorocha ji ego nakwa ala Imo steeti rụọ n'ụzọ ezighi ezi. Lee onyonyo ebe kọmịshọna okwu ala dị n'aka n'Imo steeti, bụ Enyinnaya Onuegbu gbachiri ogige 'royal palm estate' nke nwunye Rochas Okorocha nwe. Nke a mere ka ha weghara ya dịka kọmiti nyochara ya bụ ihe si nye ikike. A kurichara ụgbọala ndị so Rochas Okorocha Rochas Okorocha na-arụ ọrụ ugbua dịka onye nnọchi anya mpaghara Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ 'senate'. Ọ bụkwa onyeisi ụlọọrụ a kpọrọ 'Rochas Foundation' nke o malitere tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị. Ụgbọala ọzọ so Rochas akụriri Gọọmentị Imo steeti, malite n'ọchịchị Emeka Ihedioha, ebola Rochas Okorocha ebubo dị icheiche gbasara nrụrụaka nakwa iri ego gọọmentị. Cheta oge kọmiti e hibere maka ịnapụta ihe gọọmentị ezuru n'ohi wakporo otu ụlọ ebe ha kwuru naUloma Nwosu, nwa Rochas Okorocha, na-ezo ihe gọọmentị dị icheiche o zuru n'ohi. Rochas Okorocha: Ihe mere anyị ji kpachitụ akụnaụba ya EFCC depụtakwara ọtụtụ ụlọ na akụnụba dị icheiche nke ha boro ebubo na ọ bụ Rochas nwe ya. Ha kwuru na ihe ndị ahụ bụ ego si n'akpa gọọmentị Imo steeti ka Okorocha ji nweta ha. Mana Rochas Okorocha gwara BBC n'oge ahụ na ihe ndị ahụ niile bụ ebubo ụgha. O kwukwaua na ụjọ nnyocha anaghị atụ yadịghị atụ m - Okorocha." afirika-49903738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49903738,Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwee ohere ichi Naịjirịa?,"Ọ ga-adịkwa egwu mana enye ndị a imi, ha ga-akpọ ụtaba.",Ndị ntọroọbịa a ekweghị ekwe maka na ha na-ekwupute ihe ha ga-eme maọbụrụ na ha nwee ohere ịchị Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị mba-uba-43284820,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43284820,Oscars 2018: Kobe Bryant so na ndị nwere nrite,N'ihe ịtụ anya mere ka Kobe Bryant bụ onye ama ama ka ọgbaa basketbọọlụ n'Amerịka atụrụla ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a na-akpọ Oscars.,"Mmeri pụrụiche - Kobe Bryant emeriela O ritere ihe a maka ihe onyonyo nke eserese nwa-oge. Lee ndị ọzọ nwere nrite na Oscars emere n'ọnụ utụtụ a. Ndị mmeri: The Shape of Water nwere nrite nke 'Best picture' End of Twitter post, 1 Frances McDormand ritere nke a na-akpọ 'Best actress' maka Three Billboards Outside Ebbing, Missouri Onye ritere nke a na-akpọ 'Best actor' bụ Gary Oldman maka Darkest Hour Guillermo Del Toro ritere nke a na-akpọ 'Best director' maka The Shape of Water Get Out nke Jordan Peele dere ritere 'Best original screenplay'" afirika-48747348,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48747348,Presidential Election Tribunal: Ụlọikpe mkpesa ntuliaka ekweghi ka Atiku nyochaa 'Server' Inec,"Ụlọikpe mkpesa nke akpọrọ ""Nigeria Presidential Election Petitions Tribunal"" na Bekee akagbuola atụmatụ pati na-anọghị n'ọchịchị bụ ""People's Democratic Party"" (PDP) inyocha igwe ""server"" ngalaba ntuliaka ""Independent National Electoral Commission"" (Inec).","Ndị Ọkaiwu ise nọ na ngalaba a sị cha cha ma ncha na ha agaghị ekwe n'arịrịọ PDP na onye zọrọ ọchichị n'okpuuru ha bụ Atiku Abubakar maka ihe ndị ọzọ metụtara okwu ""server"" a. Ọkaiwu ndị a sị na ha agaghị etinyenwu ọnụ n'okwu ""server"" n'oge a. Na mkpebi ha, Ụlọikpe a sị na Inec agọọla na ha enweghị ""server"" ma kwukwa na ha ejighị usoro tecknuzu ọbụla kpokoo ọnụọgụgụ vootu gaa ""server"" ọbụla dịka PDP na Atiku siri kwuo. Ha sị ya bụrụ na ha nyere Atiku na PDP ihe ha na-arịọ, ọ pụtara na ha amalitela isiokwu mgbe na-erughi eru. Ọkaiwu Garba, bụ onye gụrụ mkpebi a sị: ""Nke ahụ agaghị enwe isi."" Ọ sị na ya bụrụ na Ụlọikpe ahụ kwenyere n'ihe PDP kwuru, ọ ga-apụta na ha ""ekwerela na enwere ""server"" ebe ọnụọgụgụ vootu atutara na ntuliaka emere n'ụbọchị 23 nke Febụwarị bara."" Akụkọ ga-amasị gị: 'Anyị na-akwadọ ntuliaka echi'" egwuregwu-47761740,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47761740,Man United vs Watford: Chi ndị Man U azọọla ha n'aka ndị Watford,Ọ bụ Marcus Rashford nyere goolu mbu na nkeji iri abụọ na asatọ nke meghere ụzọ na mmeri otu Man U taa.,"Anthony Martial nyere goolu nke abụọ n'agba nke abụọ mana Doucoure nke Watford gbanyere otu ọkpụ na nkeji iri itoolu kwa. Mmeri a ga-adịrị otu Watford mma n'obi dịka ha ka otu Man U gba bọọlụ taa dịka ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na-ekwu Ihe pụtara bụ na otu Man U nọ n'ọnọdụ nke anọ n'ọgbako ndị odogwu bụ ""Premier League Table"" na Bekee. Ọ bụ kwa mmeri nke mbụ otu Man U meriri n'okpuru Ole Gunnar Solskjaer dịka onye nchịkọta ha." afirika-42999661,https://www.bbc.com/igbo/afirika-42999661,Buharị ọ ga-eteta n'ụra ugbua?,"Ọchịchị onyeisiala bụ Muhammadu Buharị ọ ga-eteta n'ụra za akwa arịrị ọtụtụ ndị Naijiria na-akwa maka oke ihe isi ike, enweghị ọrụ, agụụ na oke ogbugbu mmadụ na-arị elu bụ ajụjụ nọzi n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ọnụ na-eru n'okwu.","Ndị bishop chọrọ ka Buhari leba anya n'ọgbaghara ndị ọchị ehi na ndị ugbo Ụnyaahụ ndị Bishọp ụka Katọlik na Naijirịa tinyere olu ha n'okwu ndị katọrọlarị ọchịchị Buhari sị na ọ kụọla afọ n'ala n'imejupụta atụmanya ndị ọha Naijirịa kemgbe o jiri rigoro n'ọchịchị afọ atọ gara aga. N'ọnwa Mee afọ 2015, mgbe o rigoro ọchịchị, Buhari kwere ndị Naijirịa nkwa atọ; ọrụ, nchekwa na ibu agha megide mmerụaka. N'ime nkwa ndị a, Buharị enweela ihe ndị o mere: O zigara ndị agha n'ugwu Naijirịa ebe ndị agha Boko Haram na-akpa ike. Ha gbara mbọ ibelata nsogbu ha site na inapụta obodo ndị Boko Haram werela nye onwe ha, ma gbapụta ọtụtụ ndị ha tọọrọ. A gbapụtara ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị Boko Haram tọọrọ gụnyere ndị nke Chibok. Buhari bidokwara agha megide mpụ na mmerụaka dịka otu EFCC jidekwara ọtụtụ ndị eboro ebubo mmerụaka dịka Sambo Dasuki, Olisa Metuh na Femi Fani-Kayode dgz. Mana ka ihe ndị a na-aga, akụnaụba NaijirIa kụrụ afọ n'ala. Nsogbu ọchịchị ya wetara Ihe isi ike jidere ọtụtụ dịka Riseshọn bidoro. Ka ihe si aga, kama iweta ọrụ, ọtụtụ ghọrọ ndị enweghịzi ọrụ. Dịka NBS siri kwuo, mmadụ karịrị nde asaa bụ ihe achụrụ n'ọrụ kemgbe ọ banyere ọchịchị. Ọtụtụ ụlọọrụ mechiri, ebe izu ohi, ntọ, na mpụ dị icheiche bawanyere. Ọtụtụ ndị otu ọchịchị ya eboro ebubo mmerụka na-agagharị n'enweghị onye ọbula ji ha, nke mere ka ụfọdụ sị n'ọgụ megide mmerụka ọchịchị ya na'alụ bụ ọgụ megide ndị otu pati ndị n'anọghị n'ọchịchị. Ndị ọchịchị Buhari e boro ebubo mmerụaka Izuụka gara aga, onye bụbu onyeisiala Naijirịa bụ Ibrahim Babangida katọrọ Buhari maka etu o si n'eso ogbugbu mmadụ na mmebi akụnauba nke ndị Fulani na-achị ehi. Onye chịburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo katọkwara Buhari maka ịkpa oke ma kwuo ka ọ ghara ịzọ ọchịchị n'afọ 2019 n'ihi ihe ọ kpọrọ amaghị achị nke butere nsogbu enweghị nchekwa, agụụ na enweghị ọrụ. Okwu ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu n'okwu ndị bishọp ndị ụka Katọlik kwuru banyere ka ihe si aga n'obodo n'ọchịchị Buhari bụ ebumnobi ndị ọha Naijirịa. Na mkparitaụka ya na onye ntaakụkọ BBC, osote onyeisi otu ndị ọkaiwu Naijiria a na-akpọ NBA n'aha ichafụ bụ Monday Ubani kwuru sị: ""Ihe niile ha (ndị Katọlịk bishọp) kwuru bụ eziokwu. Buharị emegharịghị ahụ dịka o mere oge anyị nwere nsogbu IPOB, oge anyi nwere nsogbu Naija-Delta. A gara ebe ndị a ga gbaa egwu. Orue ugbua ndị Fulani na-achị ehi na-egbusisi mmadụ ebe dị icheiche, o nweghị ndị ezigara ịga gbaa egwu wee kwụsi ihe na-eme."" Ubani kwukwara na dịka ndị Bishọp kwuru, n'ihe gbasara inye ọkwa na onyeisiala emeghị dịka o kwesịrị. Gbenga Oni Daniel, onye ọzo bụkwa ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru n'ezie na Buhari na-akpa oke. ""Ọ bụrụ na a machiri IPOB, amaghị m ihe mere eji ahapụ ndị Fulani ji egbe ka ha n'agagharị."" ""A gaghị enwezi nsogbu nchekwa ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti akwụnyeghịrị onye ọbụla dịka ha si eme ugbua."" Mana otu onye ugwu bụ Abba Kyari kwuru na ndị na-ekwugide Buharị ejighị eziokwu aga n'ihi na ha ekwughị otu ahụ mgbe Boko Haram na-akpa ike n'oge ọchịchị gara aga. N'oge garaaga, ka ọtụtụ ndị mmadụ na-eme mkpesa maka ihe isiike na-ala adịghịmma n'obodo, ndị gọọmentị etiti hụtara ya ka okwu ndị na-anọghị n'ọchịchị na-akpalite. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe ndị Bishop ụka Katolik kwụrụ na Twita:" 42775974,https://www.bbc.com/igbo/42775974,Ndị Nyocha: Yabasị a ga-enye aka ịlụso nje na-ebute ọya ụkwara ọgụ,Nchọpụta egosila na e nwere ụdị yabasị ga-enye aka iluso nje na-ebute ọrịa ụkwara a na-akpọ Tuberculosisi -- TB na aha ịchafụ -- ọgụ.,"A na-eji udi yabasi a esi nri na mba Iran. Ndị na-eme nchọpụta na-ekwenye na ihe na-aluso nje ọgụ ha wepụtara na ya bụ yabasị a na-akpọ Persian Shallot nwere ike inyere ọgwụ ndị ozo eji achụ nje ọsọ aka. Ha kwuru na akụrụngwa dị na yabasị a nwere ike inye aka gbasara nkwechiri ọgwụ TB na-eme, metutagoro ihe ruru mmadụ puku narị anọ na itoolu n'afọ 2016. Mana ha kwuru na ugbu a ka bụ ụtụtụ na nchọpụta ahụ ha na-eme, maka ha ka ga eme nyocha n'ụlọ ọgwụ. Ndị nyocha kwekọrịtara na ịhe ndị dị na yabasi a ga-emepe ụzọ iji chọpụta ọgwụ ọhụrụ gbasara TB" egwuregwu-49306587,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49306587,West Ham vs Man. City: Man. City afọnyela West ham n'akpa,"Ka afọ ọhụrụ na-ebido n'asọmpị Premier Lig, otu Man City egosila West Ham na ogologo abụghụ na nwa m etoo.",Ha jiri ọkpụ goolu ise asataghị kama otu chọọ neeti ndị West Ham mma mgbe ha zutere onwe ha. Gabriel Jesusu nyere goolu mbụ na nkeji 25 ebe Sterling so ya n'azụ na nkeji 50 na nkeji 75. Aguero ji penariti nye goolu nke anọ na nkeji 86 ebe Sterling mechiri akwụkwọ na nkeji 91. Nke a mere na Manchester City nọ n'ọnọdụ nke mbụ n'ọkwa ehibere maka asọmpị Premier Lig. 43337629,https://www.bbc.com/igbo/43337629,Gịnị bụ ọdịnihu ebe ngwuputa Ajaokuta?,Gọọmentị etịtị esila n'ọnụ Minista na-ahụ maka ịgwupụta ihe n'ọrụ igwe bụ Kayode Fayemi kwuo na ha agaghị emefu ego ọzọ n'ebe ngụpụta nke a kpọrọ Ajaokuta Steel Mill.,"Amalitere ụlọọrụ ngwuputa igwe nke a na afọ 1979 Nke a bịara ebe Minista a kwuru na gọọmentị etiti ndị ochie etinyela ihe ruru njeri dọlla asatọ na ngalaba a mana ọ nweghị ihe eritala na ya. Ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abuja na ha na-akwado ịnye iwu ga-eme ka ulọọrụ ọbụla zuruoke ịkikere ịbido ọrụ n'ebe ngwuputa ahụ dị na Kogi steeti. Ọ sịkwa na ọ ghọtaghị ịhe ndị ụlọomeiwu ji aluso iwu a ọgụ ebe ha nara njeri naira abụọ iji wepụta ikikere nke a. Nke a butere nkewa n'etiti ndị mmadụ n'elu igwe okwu, ụfọdụ kwetara: End of Twitter post, 1 Ndịọzọ chere na anyị kwesiri inwe ndidi: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55572527,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55572527,George Obiozor: Onye bụ onyeisi ọhụrụ Ohanaeze Ndigbo a?,Dịka Ohanaeze Ndigbo ahọpụtala George Obiozor dịka onyeisi ọhụrụ ga-edu ha ruo afọ anọ ọzọ.,"Ka anyị tụlee odogwu nwoke a ga-akwọ ụgbọ ndị Igbo maara nke ọ tagbutere iji rụọ ọrụ e tinyere ya n'aka. Onye bụ George Obiozor? George Obiozor bụ nwafọ Awo-Omamma dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma Comprehensive n'afọ 1959 ruo 1963. Gụọ akwụkwọ dị elu na 'Institute of African Studies Switzerland (1967), mahadum South Tacoma USA (1967), mahadum Columbia (1968). Ọ nwere ọzụzụ na ngalaba ndị gụnyere; ọkaiwu mbaụwa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya. Ọ kuziri nkuzi n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma, Mahadum Columbia. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye na-anọchịteanya Naịjirịa na mba dịka Amerịka (2004 ruo 2008), Izrel (1999 ruo 2003), Cyprus. Ma rụọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Institute of International Affairs'. O dere akwụkwọ di iche iche banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya. Etu o si merie na ntuliaka a Obiozor ji vootu narị atọ na anọ (304) si na mpaghara Ọwụwanyanwụ tinyere Rivas Steetị merie ndị ọzọ zọsịrị ya ọkwa ọchịchị onyeisi Ohanaeze. Nke a na-abịa dịka mmadụ atọ n'ime mmadụ ise so zọọ ọkwa a tụgharịrị obi ha ma dọnyere Obiozor ukwu dịka ntuliaka na-amalite. Nke a mere Obiozor ji merie otu onye gara n'ihu n'ịzọsị ya ọkwa ahụ. Ndị ọzọ a họpụtara n'ọkwa ndị ndu Ohanaeze Ndigbo gụnyere; Okey Emuchay dịka odeakwụkwọ ukwuu, Eze Beatrice dịka onye njikọ ego, Bartholomew Okorie dịka onye ndekọ ego. Ndị ọzọ bụ Alex Ogbonna odekwụkwọ mgbasaozi, Ojobu Joseph Obinanma dịka onye ndụmọdụ iwu, Nnamdi Eze dịka nye ndekọ ego. Ndị a họpụtara dịka ndịisi Ohanaeze n'ụfọdụ steetị bụ Maazị Lawrence nke Abia, Afam Okeke nke Anambra, Emeke Okoli nke Delta. E kposaala ọchịchị Ohanaeze Ndigbo nke Nnia Nwodo nọ n'isi ya dịka a na-ache ka e mee ntuliaka ọhụrụ. Onye nyere atụmatụ mkposa ahụ bụ ọkammụta ABC Nwosu ebe Sịnetọ Ben Obi kwadoro ya. Ha kelere Nnia Nwodo maka ọchịchị pụrụiche ọ chịrị Ohanaeze Ndigbo n'ime afọ anọ Ebe niile achakela dịka Ohaneze Ndigbo amalitela ntuliaka iji họpụta ndị ndu ọhụru ga-akwọ ụgbọ ruo afọ anọọ ọzọ n'ọgbọegwuregwu Dan Anyiam dị n'Owerri, n'Imo steeti. Ndị niile e ji eme ọnụ nwere agba n'ala Igbo wuchiri ebe ahụ iji họpụta ndị ndu ọhụrụ nke Ohanaeze Ndigbo. Ndị a gụnyere; Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo Steetị, Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi, Minista Tekịnụzụ bụ Ogbonnaya Onu, Minista akụrụngwa ọnatarachi bụ Uche Ogah. Ndị ọzọ gụnyere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohanaeze na-apụ apụ, Gary Igariwe bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo, Obi Ọnicha bụ Igwe Afred Achebe, Ikedi Ohakim, Emmanuel Iwuanyanwu na ndị ọzọ. Onye kpere ekpere mmepe bụ Achibishọp ndị Anglikan n'Enugwu bụ Emmanuel Chukwuma. Onye nyere ọjị bụ Ikedi Ohakim bụ aka chiburu Imo dịka ọ bụ onyeisi kọmitii ime obodo na-ahazi ntuliaka a. Ka nke ahụ gachara, Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo na-apụ apụ were ọgbọ ma kwuo okwu ikpeazụ ya. N'okwu ya, ọ kọwara ọtụtụ ọrụ ọ rụrụ mgbe ọ bụ onyeisi Ohanaeze ma rịọ ka ndị Igbo iwe na-ewe n'ebe ọchịchị ya nọọ mịnye mma ha n'ọbọ. Nwodo sị malite echi na ọ ga-ewere ọkwa dịka onyeisi otu a 'Southern and Middle Belt Assembly' nke o so hiwe. O kelere ndị ndu Igbo niile maka ịdọnyere ya ugwu n'ọchịchị ya n'ime afọ anọ gara aga. Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma nyere ekele nnabata dịka onye na-ele Ohanaeze ọbịa na steetị. Ọ kpọrọ oku ka ndị Igbo dị n'otu, nwee ofu obi na otu olu iji hụ na nwetere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ha na-achọ. N'okwu nke ya Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Dave Umahi sị na ọ bụ naanị ntuliaka e mere taa bụ nke ndị gọvanọ Ọwụwanyanwụ ga-anabata. O kelekwara Nnia Nwodo n'ọrụ ọ rụrụ n'oge ọ chịrị Ohanaeze ma sị na obi juru ndị gọvanọ afọ n'ọrụ ya. Otu mpaghara Ohanaeze Ndigbo emeela ntuliaka ha n'Enugwu Ọtụtụ ndị nwere agba n'ala Igbo Otu mpaghara Ohanaeze Ndigbo emeela ntuliaka ịhọpụta ndị ndu ọhụrụ ha taa ụbọchị 9 Jenụwarị 2020 n'Enugwu. Ndị a họpụtara dịka ndị ndu na ntuliaka aka gụnyere; Chidi Ibeh nke Imo Steetị dịka onyeisi Ohanaeze ọhụrụ, Dimm Uche Okwukwu nke Rivas Steetị dịka osote onyeisi Ohanaeze. Ndị ọzọ gụnyere Okechukwu Isiguzoro nke Abia Steetị dịka onye odeakwụkwọ ukwu. Mana Isiguzoro gwara BBC Igbo na ọ naghị mgbe e mere ntuliaka ahụ na o nweghi okwu ọ ga-ekwu ugbua banyere ya. Onye haziri ntuliaka bụ Prince Richard Ozobu bụ onyeisi kọmitii nke ntuliaka e mere n'Enugwu. Mana ntuliaka Ohanaeze Ndigbo nke Nnia Nwodo bụ onyeisi ya ka ga-adị n'Owere n'ụbọchị 10 ọnwa Jenụwarị a. Ufọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo Onyeisi ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo bụ Okechukwu Isiguzoro akọwala etu obi dị ha maka ọgbaghara dị n'etiti Ohanaeze Ndigbo. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya ka a mata uche ndị ntoroọbịa maka esemokwu dị n'etiti Ohanaeze Ndigbo n'oge ntuliaka ha. Isiguzoro sị na dịka ọ dị ugbua na Ohanaeze Ndigbo nwere ọtụtụ nsogbu, na e nwere ụzọ ntuliaka abụọ a na-ahazi. Ọ sị na otu bụ nke Nnia Nwodo na-ahazi ebe ga-adị n'Owere n'ụbọchị 10 nke ọnwa Jenụwarị a, ebe nke ọzọ bụ Richard Ozubu na Uche Okukwu na ahazi ga-adị n'Enugwu n'ụbọchị 9 nke ọnwa Jenụwarị. Isiguzoro gara n'ihu sị na Ohanaeze ndigbo achọghị ime udo n'etiti ha ma bịakọọ ọnụ na nsogbu ga-adị. O kwuru na ọ bụrụ na e nwee ntuliaka ụzọ abụọ n'etiti Ohanaeze Ndigbo na ndị ntoroọbịa ga-ewere ọchịchị n'ike. Na ha ga-agbachi isiụlọọrụ Ohanaeze Ndigbo ruo mgbe ha ga-eme udo n'etiti ha. O rụtụrụ aka na nsogbu dị n'etiti Ohanaeze ugbua malitere kamgbe afọ 2017 Nnia Nwodo were ọchịchị dịka onyeisi ha. Mana odeakwụkwọ Ohanaeze Ndigbo bụ Emeka Attama na nzaghachị sị na okwu ndị a ha na-ekwu bụ okwu asị. Na o nweghi ihe ọbụla ha nwereike ime, na ha bụ ndị na-achọghị ịnụ maka ọ dị mma ndị Igbo. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị otu ntuliaka ka Ohanaeze Ndigbo na-eme n'Owere n'ụbọchị Sọnda na o nweghi onye ọbụla nwereike ịkwụsị ya. Ọtụtụ ndị nwere agba n'ala Igbo Ntuliaka nke otu Ohanaeze Ndigbo na-akwado ịme n'Owere n'ụbọchị ụka ebutela ọtụtụ esemokwu na ọgbaghara. Nke mbụ bụ na onyeisioche otu a kpọrọ Ohanaeze Ndịgbo General Assembly bụ Basil Onyeachonam kwuru na ọ ga-eji ndị uweojii nwụchie onye ọbụla pụtara ịzọ ọkwa na steeti ọbụla ha nọ. Nkọwa ya bụ na ịzọ ọkwa ọchịchị otu ahụ dara iwu n'ihi na ọ bụ naanị otu nke ọ bụ onyeisi ha nwere ikike ịnọchite anya ọha na eze Igbo n'iwu Naịjirịa. O kwukwara na oge eruola ndị okenye dịka Ọkankuzi George Obiozor ga-eji zuo ike ma nye efe ka ndị ntorobịa were oche ọchịchị. N'otu aka ahụ, Ikedi Ohakim chịburu Imo steeti na-ekwu na ọ ga-akpụpụ nwa amadị aha ya bụ Uche Okwukwu ụlọikpe maọbụrụ na o megidee iwu nke ụlọikpe tinyere maka ya ịhibe ntuliaka nke aka ịche n'ebe nke Ohanaeze ndigbo dị. Kedụ ihe na-eme n'otu Ohaneze Ndịgbo? Basil Onyeachonam Onuorah sị na ọ bụ ya bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo General Assembly Emeka Attamah bụ ọnụ na-ekwuchitere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndị Igbo gwara BBC na ndi a niile na-ekwu okwu asị na ntuliaka Ohaneze agaghị eme na-ekwuru onwe ha. Ọ sị na o nweghi onye nwere ikike ịkwụsị ntuliaka ahụ makana ọ bụ naanị Ohaneze Nigbo Nnia Nwodo na-achị ugbau ka a ma ama. Mana, Ọkaiwu Onuorah na-ekwusi ile na ntuliaka ọbụla a na-akwado ịme megidere iwu n'ihi na ohere adịghị n'ọchịchị ọbụla maka na ọ bụ ya nọ n'ọkwa. Ọ gwara BBC Igbo sị; ""anyị agwaala ha bụ ndị okenye bata bị anwere oche na 'Elders council' ka anyị nara ha ndụmọdụ"" Ọ sịkwa: ""Achọghị m ka anyị nwee nkewa n'etiti anyị ya mere anyị ji sị ha (Ohaneze ndị ọzọ) bata n'ime (nke anyị)"" ka o kwukwara Ọ dị ka ndị a na-ekwu ka agharị ime ntuliaka si n'ụra pụta Goddy Uwazurike bụ otu n'ime mmadụ ise na-azọ oche onyeisi Ohaneze Ndigbo kwuru na ndị a na-ekwu ka a ghari ime ntuliaka ịhọputa aka ga-achi Ohaneze n'ụbọchị ụka amaghị ihe ha na-ekwu. Maazi Uwazuruike sị na kemgbe ehibere Ohaneze n'afọ 1976 a na-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-achị Ohaneze kwa afọ anọ. Ọ sị na ọ bụ ndị Imo ka o ruru ịhopụta onye ga-abụ onyeisi Ohaneze. Ọ sị: ""Onye ọbụla ga-asị na ya ga-achọ ịkpasa anyị na-ezuzu ezuzu, makana ha na-ebuso ala nna ya."" Ọ sịkwa na Ohaneze bụ otu Igbo ji aga mba ma bukwara ọnụ na-ekwuchitere Igbo. Ndụmọdụ Nwodo nyere ndị na-abata n'ọchịchị Ndị na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị ahụ gụnyere Goddy Uwazurike nakwa Ọkankuzi George Obiozor. Ọ dụrụ ha ndụmọdụ gbasara sị ha gbaa mbọ niile hụ na chekwara oke na ọdịmma ndị Igbo. ""Ndụmọdụ m ga-enye ha bụ ka ha hụ na ndị Igbo ji otu olu na-ekwu okwu"" Ipob na Ohanaeze Ndigbo O kwurukwara ka ndị Igbo niile ndị ebighi n'ala Igbo lọghachite jiri ala Igbo mere ụlọọrụ na ụlọ nrụpụta . ""Ọ bụrụ na ndị Igbo mee nke a, ndị na-azụ ahịa n'aka ha ga-achọrọ ha bịa ala Igbo"". Na ngwụcha, o kwuru na ọ bụ olileanya ya na ntuliaka nke ehibere maka ụbọchị Sọnde ga-aga ọfụma n'enweghi nsogbu ọbụla. Ọ bụ n'afọ 1976 ka ehibere Ohaneze Ndigbo" afirika-47195879,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47195879,Uwe ndị bịara Grammy yi ga-amasị gị,"Ọ bụ eziokwu na nturugo Grammy abịala gafee, mana otu ihe na-agaghị apụ ọsịsọ n'ọnu ma anya ndị mmadu bụ ụfọdụ uwe ndị mmadụ yi bịa ya bụ mmeme.","Mmadụ dịka Dolly Parton na Diana Ross nwetere nturugo. Cardi B, Lady Gaga nakwa Jennifer Lopez sokwa na ndị ritere nturugo Grammy n'afọ 2019. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ekwu na soshal na ọ bụ ụmụnwaanyị ka nturugo Grammy nke afo a dabara. Lee ụfọdụ uwe ha yi na-aba n'anya. Cardi B Lady Gaga Michelle Obama Diana Ross Dua Lipa Brandi Carlile Kacey Musgraves Ella Mai Jennifer Lopez Alicia keys Brandi Carlile Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46793650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46793650,Buhari: 'Kedụ ihe m ga-emere ndị Igbo meta ha mma'?,"Ọsịsa onyeisiala Buhari sara ndị ntaakụkọ ụlọọrụ ""Thisday"" na-ekpo Obodo ọkụ ọkachasị okwu gbasara ihe o kwuru maka ndị Igbo.","O kwuru na otu onye kwuru na ọ naghị emeta ndị Igbo ọfụma. N'ọnụ ya, ""mgbe m meriri ntuliaka 2015, ewetere akwụkwọ eji tụkọta vootu, m chọpụta na ndị Igbo nyere m vootu na-erughị puku narị itoolu na ụma (198,000) bụ vootu otu okpuru ọchịchị nwere ike inye mmadụ. ""N'agbanyeghị nke a, enyere m ha ọkwa minista anọ, kedụ etu ọzọ ị chọrọ ka m si wee meta ha mma?"". Mgbe onye ntaakụkọ gụnyere onye Igbo bụ onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Amerịka, onyeisiala Buhari kwuru ""biko gụpụ onye ahụ makana o dere akwụkwọ megidere m. ""Ya mere m ji tufuo onye dere akwụkwọ na m na-emegide ndị Igbo, ma ya ma akwụkwọ ya"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49466917,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49466917,Enugu state: Ndị omekome awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii n'Ikirike,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Ikirike dị n'Idaw-river, n'Enugwu steeti.","""Enweghi onye nwụrụ na ya bụ mwakpo, mana mmadụ abụọ maọbụ atọ merụrụ ahụ"" dịka Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke steeti ahụ si kwuo. Ndị uweojii kwuru na ihe a mere ebe elekere abụọ nke n'isi ụtụtụ, ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọstụ 2019. Ndị omekome a bu mma na osisi, ji aghụghọ na ha bịara ime mkpesa bata n'ime ụlọorụ ndị uweojii ebe ha nọ kpaa mkpamkpa ha ma gbalaga. Amarizu kwuru na ha atụọla imi n'ala iji chọpụta ndị omekome ahụ. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwakpo a ebe a: Ihe nkiri a ga-amasị gị: 'Gọọmentị Enugu state sị anyị kpochapụ ebe ndị ntọrị na-ezo'" afirika-56871324,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56871324,"Hope Uzodinma: ""Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ịgba ụlọ Gọvanọ Uzodinma ọkụ""- Kọmịshọna mgbasa ozi Imo Steeti",Kọmịshọna mgbasa ozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ọ bụ ndị omekome ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado chọrọ iwakpo ụlọ gọvanọ kama ndị nchekwa nọ n'ụlọ Gọvanọ hụrụ na ha emeghị ihe ha bu n'obi.,"Ọ bụ na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere ka o siri kọwaa ebe gọọmentị Imo steeti kwụ. Emelumba kwuru sị, ""Ndị nchekwa ekweghị ha mee ihe ha chọrọ ime kama mmadụ otu naọbụ abụọ nwụrụ"". ""Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-akwado mkpamkpa a na-eme"" O kwuru na ọ bụ ndị iro ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado na-eme ihe ndị a. Emelumba kọwara na ihe ndi a bu n'obi bụ ka ha gosi ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha nwereike ịwakpọ ụlọ gọvanọ Imo steeti na enweghị ebe nwere nchedo kama ha emewụghị ya. Mana ihe a na-eme kwa na steeti ọzọ, nke Imo ọ pụrụ iche? O kwuru kwara sị, "" Ihe na-eme n'Imo steeti di iche na ihe na-eme na steeti ndi ọzọ"". Ọ kọwara na-enwere ndị kwuru na mbụ na ha ga-ebute ọgbaaghara n'Imo steeti. Kedụ maka ozi a gọọmentị ga-ezi ndị Imo steteti ụjọ na-atụ? O kwuru na Gọvanọ nọ ya ma gwa ndị Imo steeti ka ha hapụ ịtụ ụjọ n'ihi na gọọmentị na-agba mbọ ihu na ha jidere ndị omekome a tupu ha eme ihe ha bu n'obi. Etu ndị amaghị ndị ha bụ siri gbaa ụlọ Gọvanọ Imo steeti ọkụ Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Godson Orlando Ikeowu ekwuola na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa atọ ka ndị wakporo ụlọ aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma. Maazị Ikeokwu sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ""Civil Defence"" abụọ na otu onye uweojii ka ndị a ji egbe gburu. Otu onye hụrụ oge ihe a mere gwaburu BBC na ndị bịara mwakpo gburu onye nche no n'ụlo ahụ. Onye ahụ sịkwa na ha bụ ndị obodo ahụ ma onye ahu egburu, ọsịkwa na o nwere mmadụ abụọ ọzọ ndị ahụ gburu dịka ha na-abịa obodo ahụ. Obodo Omuma dị n'okpuru ọchịchị Oru East nke Imo steeti. Gọvanọ Uzodinma n'onwe ya anọghị n'ụlọ ya oge mwakpo a mere dịka ọ gara Abuja izute Onyeisiala Muhammadu Buhari. A na-eche ne ọ bụ maka mwakpo dị iche na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwu mere o jiri gawa njem ahụ. Dịka onye hụrụ ihe a mere siri gwa BBC Igbo na ndị a bịara mwakpo a ji ụgbọala na-ebu aja, Siena, na ụgbọala eji ebu mmadụ. Ọ sịkwa na ya busi tyre moto n'elu ụgbọala ha. Ọ sị: ""Anyi nọrụ ka egbe na-ada. Obere oge anyi hu nnukwu anwụrụ. Ka ihe a mechara anyị gazie hụ ka ụlọ na-agba ọkụ."" Dika o siri kọwa, ndị nchekwa ndị ọzọ nọ ebe ahụ gbara ọso. Orlu Crisis: ""Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"" Ihe onyonyo na foto ndị etinyere na soshal midia na-egosi ụlọ nche anwụrụ ọkụ na-awụpụ na ya nakwa ụgbọala na-agba ọkụ dịka ndị mmadụ na-agba mbọ ịgbanyụ ya. N'ihe onyonyo a gosiri onye nọ n'ala n'ihu ụlọ Uzodinma." afirika-50997776,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50997776,2020 Prophecies: Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma,"Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik na ndị ntorobia Imo steeti etinyela ọnụ n'ịkatọ amụma Fada Ejike Mbaka kwuru ebe ọ sị na Hope Uzodinma zọrọ oche n'okpuru APC, ga-eweghara ọchịchị steeti ahụ n'afọ a .","Ụkọchukwu Ejike Mbaka Bishop dayọsis katọlịk dị n'Ụmuahịa bụ Luscious Ugorji kwuru na ụka katọlịk ebe Mbaka bụ ụkọchukwu ""anaghị agba afa ka ndị dibịa"". ""Nke mere na ha adịghị enye ndị ụkọchukwu ha ikike ikpebi onye ga-emeri n'ikpe dị n'ụlọikpe."" dịka ụlọ mgbasaozi ""Sun newspaper"" si depụta. N'otu aka ahụ, ndị ntorobia nke Isdore Chukwuemeka na-anọchiteanya ha, kwukwara sị ka Mbaka hapụ gọvanọ Emeka Ihedioha aka n'ihi na ndị mmadụ tụnyeere ya makana ọ masịrị ha, ma kwuo na ọrụ Ihedioha na-arụ n'Imo masịrị ha. A gba m aka ka m gbuchara enyi m nwaanyị: Adeeko Owolabi bụ nwataakwụkwọ dị afọ iri abụọ na atọ e jidere maka iso kpaa nkata igbu enyi ya nwaanyị, ekwuola na ọ hụghịdị ihe o ji maka ya kpaa arụ a. Owolabi kwuru na o gburu Favour enyi ya nwaanyị ka o jiri ya gwọọ ọgwụ ego, mana ka ọ gwọchara ya bụ ọgwụ, o jighi rose, o jighi ndawịị. Ọkụ gbara n'Ọyọ steeti Foto a si n'ahịa Timbershed gbara ọkụ n'Enugwu n'afọ 2019 Ọkụ agbapịala ngwongwo ndị mmadụ ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa dị n'obodo Akesan dị n'Ọyọ steeti. Ka ndị mmadụ na-ewe iwe ọkụ ọgbụgba ahụ, mgbọ tụrụ otu nwatakịrị dị afọ iri na anọ ebe ahụ, kama ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha na-achọ onye gbapụrụ mgbọ ahụ makana o sighi n'aka ndị otu ha. Ọkụ na-agba n'Ọstrelia Ọkụ na-agba na New South Wales Ndị mmadụ atụkọtala nde dọla iri na atọ n'ime ụbọchị abụọ, a ga-eji nyere aka menyụọ ọkụ oke ọhịa na-agba n'obodo New South Wales dị na mba Ọstrelia, dịka onye ọkpaọchị a ma ama bụ Celeste Barber rịọrọ arịrịọ. Ọkụ a ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ma chụpụ ihe karịrị puku iri abụọ n'ụlọ kemgbe ọ malitere. N'egwuregwu, Liverpool na Everton ga-ezute ọzọ n'ọgbọegwuregwu Anfield ebe ha abụọ ga-ama aka ịmata onye ga-epiobanye n'agba nke anọ n'asọmpi Iko FA. Ndụmọdụ maka oke ụgụrụ na-ekunu? Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti, adụọla ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya iji gbochie ọkụ ọgụgba n'oge ụgụrụ a. Na ndụmọdụ ya, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta na-agbanyụsị nakwa kwụpụta ihe ndị na-eji ọkụ latrik arụ ọrụ ma ha na-apụ apụ, nakwa gbaa mbọ nwee ihe e ji emenyụ ọkụ nke bekee kpọrọ extinguisher. Trump ka na-aba mba? Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola sị na mba ya na-ede ọdọ iri ise na abụọ dị na mba Ịran ha ga-ebu ọgụ agakwu ma ọ bụrụ na Tehran buru ụzọ wakpoo ndị Amerịka. Trump kwuru na Amerịka achọghị mmaja ọzọ sitere n'aka ndị Ịran, ma ọ bụghị ya, ha agaghị egbu oge iwakpo ha ebe ọ ga-eru ha n'ọkpụkpụ. Onye ka ike ga-agwụ? Chelsea na Nottingham Forest ga-akwata ya na Stamford Bridge taa, ịmata onye ga-agafe na onye ga-efere asọmpi FA aka, dịka a na-akwado ibanye agba nke anọ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee emume ịwa akwa ndị Obowo" afirika-45105596,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45105596,Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ - Nwaafọ ji Pidgin akọwa bọọlụ,Okenna Benjamin ji asụsụ pidgin kọwaa egwuregwu bọọlụ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke gara aga n'ụlọọrụ mgbasa ozi ndị Super Sports.,"Na mkparịta ya na BBC Igbo, Benjamin kwuru na ọ bụ mkpebi nke ime onwe na ịhụ egwuregwu bọọlụ n'anya mere o ji nwete ọrụ ịkọwa asọmpi bọọlụ. O kwuru na ụzọ eji eme nke ọma n'ịkọwa egwuregwu bọọlụ bụ ịhụ bọọlụ n'anya ịgụ akwụkwọ gbasara bọọlụ, ige ndị ka gị n'ọrụ bọolụ ntị nke ọma." afirika-53668503,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53668503,Ihe nwaanyị na nwoke kwesịrị ịma maka ịgbakọ mgbe nwaanyị na-eyi akwa,"Ndị Igbo na-asị na ihe onye amaghị bụ ya okenye mana ikwu amaghị, ibe ezi ya.","Ọtụtụ mgbe, nsogbu amụtaghị nwa na-esite na di na nwunye amaghị ihe ha kwesịrị ịma maka ihe ndị na-eme n'ahụ nwaanyị kwa onwa, nke gụnyere oyiyi na ndapụ akwa nwa nke Bekee kpọrọ, 'ovulation.' Ọtụtụ ndị mmadụ ma maka nsọ nwaanyị (menstruation) nke na-eme n'ọnwa n'ọnwa, mana ọ bụghị mmadụ niile maara isi a hụrụ kwawa okpu bụ oyiyi na ndapụ akwa nwa, nke na-eme kwa izuụka abụọ tupu nwaanyi ahụ nsọ ya. Oyiyi na ndapụ akwa nwa nke ụfọdụ ma dịka ọnọdụ ụga maọbụ ọnọdụ izi, bụ ntọhapụ akwa site n'akpa akwa nwaanyị nke ụfọdụ na-akpọ 'ehe' (ovaries) gawa n'eriri akpa nwa ebe ọ ga-ezute olulu nke Bekee kpọrọ 'sperm', were ghọọ nwa ma ọ bụrụ na ya bụ nwaanyị na di ya enwee mmekọrịta. Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọmụmụ siri kọwaa, ahụ nwaanyị na-akachasị anabata nwa oge 'ovulation' mere. Dkt Joseph Akinde kọwara na ""Ọ bụrụ na di na nwunye nwee mmekọrịta otu abalị maọbụ atọ tupu 'ovulation' ebido, nwaanyị ahụ ga-atụrụ ime."" Mana dịka nwaanyị ọbụla nwere oge o ji ahụ nsọ ya, ha niile nwekwara oge dị iche iche ha ji enwe 'ovulation' ha. Na mbido Nwa nwaanyị ọbụla na-ebu akwa ruru otu nde maọbụ atọ (1-2m) apụta n'ụwa. Ọ bụ dịka nwa ahụ ruru ihe e ji agbọghọ eme ka akwa ndị ahụ ga-ebido ịpụ ya n'ahụ kwa ọnwa ma ọ bụrụ na ya nwoke enweghị mmekọ aramara. Njirimara ọnọdụ izi Dkta Akinde sị na ụfọdụ ihe nwaanyị ji amata na o nwere oyiyi na ndapụ akwa bụ na ""ụfọdụ obere ọbara na-apụta, ụfọdụ na-enwe afọ ọtịta maọbụ afọ mgbu ga-abịa nwa oge, ihe dị ka otu nkeji maọbụ ruo otu ụbọchị mana ọ naghị akarị otu ụbọchị."" Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke Otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo, na ọvulation nke ya na-eme ka ""ara m zaa na-anyị m arọ"". Mana o bụghị nwaanyị niile na-enwe njirimara doro anya ha ji ama oge oyiyi nakwa ndapụ akwa nwa ha. Ya mere o ji dị mkpa ịgụkọ ya n'ụzọ ọ ga-edo anya. Ụzọ ị ga-esi gụkọọ 'ovulation' Dịka Joseph Akinde bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị si kọwaa, e nwere ụzọ ole na ole nwaanyị nwere ike isi gụkọọ 'ovulation'. Ha gụnyere: 1. Ngụkọ e ji kalenda agụ kwa ọnwa Ihe ị kwesịrị ịma maka ịgbakọ 'ovulatịon' 2. Iji ""Basal body temperature"" gụkọọ ya Basal body temperature bụ ọnọdụ ahụ gị (ma ọ dị ọkụ ka ọ dị oyi) oge ị na-ezu ike. Dịka Akinde siri kwuo, nwaanyị na-eji igwe e ji agụkọ ka ahụ onye si dị ọkụ maọbụ jụọ oyi ele onwe ya site na itinye ya n'okpuru ire ya ma o teta ụra, tupu ọ hapụ akwa ya. Ọ na-akanyekwa ihe ọ chọpụtara n'akwụkwọ kwa ụbọchị n'akwụkwọ nke Bekee kpọrọ 'graph'. ""Ọ na-eme nke a kwa ụbọchị, ọ ga-ahụ ụbọchị ọ ga-agbalite karịa etu ọ na-adị na mbụ. Nke a bụ oge Oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị. "" Akinde sị, ""Ụbọchị ọbụla 'temperature' ya gbara obere tupu ọ gbalitekwa, ọ mara na ọ bụ ụbọchị ahụ bụ ọnọdụ izi ya."" 3. Iji 'Ovulation test kit' gụkọọ ya A na-eji akụrụngwa agụkọ ọnọdụ mmiri ahụ nwaanyị iji mara mgbe nke a kpọrọ 'leutinizing hormone' (LH) rịrị elu na mammịrị nwaanyị. 'Leutinizing hormone' na-arịkarị elu awa iri na abụọ (12 hours) na iri atọ na isii (36 hours) tupu ọnọdụ ụga. Dịka dọkịta ahụike ụmụnwaanyị ọzọ aha ya bụ Dkta Olusegun Akeredolu si kọwaa, ""i nwere ike iji mammịrị nakwa asọmmiri ele, iji mata oge ọnọdụ izi gị tunyerela n'ụkwụ."" 4. Iji nnyụsịta ọtụ (vaginal discharge) Bido n'oge nwaanyị hụrụ nsọ ya rue oge ọ ga-ahụ ọzọ, ọ na-ahụ nnyụsịta ọtụ dị n'ụdị na ụdị. Dịka ụlọakụkọ nchọpụta ahụike bụ MedicalNewsToday si dee na websait ha, mbido 'cycle' nke na-eme n'ụbọchị mbụ rue ụbọchị nke ise, na-abụ oge nsọ nwaanyị na-eme. Ihe ga na-apụta nwaanyị n'ahụ ya na-abụkarị ọbara. A hụchaa nsọ (ụbọchị ise rue iri): Na mbido ya, naanị ntakịrị nnyụsịta ọtụ nke ga na-anya anya na-apụta. Nwaanyị ịtụrụ ime n'oge a rara ahụ. Tupu oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị nke bụ ụbọchị 10 rue 14; mmiri ahụ nwaanyị a kpọrọ estrogen na-agbalite. Nnyụsịta ọtụ na-apụta ya n'ahụ anaghị ebu ibu, kama ọ na-acha nzu nzu (cloudy). Ụbọchị oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị (Ụbọchị 14): Akinde kọwara na ""Ọ bụrụ na nnyụsịta ọtụ dị ntakịrị, na-acha ka mmiri ma na-alọ alọ nke ukwuu, ị mara na ọ bụ oyiyi na ndapụta akwa nwa."" N'otu aka ahụ, websaịt MedicalNewsToday kwuru na ọ bụrụ na i tinye nnyụsịta ọtụ a n'etiti mkpịsị aka gị dọtịa ya, ọ nwere ike ịdọtị rue 'inch maọbụ karịa."" A hụchaa oyiyi na ndapụ akwa nwaanyị site n'ụbọchị 14 rue 22, mmiri ahụ nke a kpọrọ 'Progesterone' ga-arị elu ma n'ahụ nwaanyị nke ga-amịkọ nnyụsịta ọtụ. Nke a ga-eme ka ọ na-acha nzu nzu ma e mechaa riwanye nne. Tupu ị hụ nsọ gị (ụbọchị 22 rue 28): Dịka nsọ gị na-eru, nnyụsịta ọtụ ga-arọ arọ dịka ihe e ji anya ihe. O nwekwara ike agaghị enwe ihe ga-apụta nwaanị n'ahụ ya abalị abụọ maọbụ otu tupu ọ hụ nsọ ya. E tere ogiri, e tere ụgba, nsogbu dịka ọrịa ịba, ọrịa nwaanyị, nakwa oke ndọlị (stress) nwere ike ikposa ụzọ ndị a dị iche iche e si agụkọ ọnọdụ izi, dịka Dkta Akeredolu siri kwuo. Dr Akinde: Mkpa Ngụkọ 'ovulation' na-egbokarị Ihe mere ngụkọ ọnọdụ izi ji dị mkpa Ngụkọ oge nwaanyị na-anọ n'ọnọdụ izi abụghị naanị na ọ na-enyere di na nwaanyị aka ịmata oge ha ga-adịnwu ime, ọ na-enyere nwaanyị aka ịmata oge ọ ga-agbara aramara ọsọ, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịdị ime. Dr Akinde sị, ""Ngụkọ na-egbokarị mkpa ma ọ bụrụ na di nwaanyị anọghị nso maọbụ na nwaanyị abụghị naanị ya ka di yana-alụ, ọ ga-eji ngụkọ ahụ mara oge ya na di ya ga-anọkọ ka ọ dị ime."" ""E meghị etu a, nwaanyị bụ naanị ya ka di ya na-alụ nwere ike imekọ ihe dịka ugboro atọ n'otu izuụka , o nwe ike tụrụ."" Nke ọzọ bụ na ọ na-enyere nwaanyị aka ịmata oge nsọ ya ga-abịa ọzọ, ka o were jikere nke ọma ma gbalahụ imenye onwe ya ihere ụzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43708726,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43708726,Akụkọ kachasị taa: Anambra steeti sozi na ndị na-eme mmanụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Anambara steeti esonyela steeti ndị na-emepụta mmanụ. Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka obodo ndị na-emepụta mmanụ na Naịjirịa bụ Prince Mike Emuh kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị eze Anambara steeti okwu ụnyaahụ. Onyeisiala mba Sierra Leone na-ele anya n'ọgbaaghara ndị na-akwado ya butere Onyeisiala ọhụrụ nke mba Sierra Leone bụ Julius Maada Bio eguzobela otu ga-enyocha ebubo ọgbaghara n'etiti ndị na-akwado ya na ndị na-akwado onye ya na ya zọrọ ọchịchị bụ Samura Kamara. Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị na akwado Kamara ọkachasị ụmụnwaanyị na ụmụaka hapụrụ ụlọ ha maka agha ndị na-akwadọ Bio busoro ha. Ndị ọrụ n'ọdọ ụgbọelu na Jamini na-agba abụbọ ọrụ Njem ụgboelu na mba Germany ga-akpụ afọ n'ala taa ebe ndị ọrụ ha chọrọ ịgba abụbọ ọrụ. Ụgbọelụ Lufthansa kagbru ọtụtụ njem ha kwesiri ime taa maka na ndị na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu ha ajụla na ha agaghị arụzi ọrụ. Na egwuregwu, Naịjirịa eritela olaedo atọ n'asompi egwuregwu Commonwealth Esther Oyema, Ndidi Nwosu na Roland Ezuruike eritala ọlaedo site na-ibu ihe nke ngalaba ndị ọlụsị. Ihe nrite Naịjirịa nwetarela ruru asaa nke gụnyere sịlịva anọ na ọlaedo atọ. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Ụmụ Naịjirịa ekwupụala uche ha gbasara nkwupụa onyeisiala Buhari na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019. Ntuliaka 2019: Ndị mmadụ ekwuola obi ha gbasara Buhari Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42914505,https://www.bbc.com/igbo/42914505,Nwụchị ndị Kameruun: UN akatọọla mba Naịjirịa,Mpaghara otu United Nations na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ akatọọla mba Naịjirịa maka ịchabị iwu jịkọtara mba ụwa niile mgbe ha kwere ka Gọomenti mba Kameruun bịa nwụchie onye ndu ndị mpaghara Kameruun na-asụ bekee na ndị otu ya.,"Ayuk Tabe bị na mba Naịjirịa ụfọdụ oge tupu anwụchịe ya Ndị otu a bụ UNHCR n'olu bekee, kwuru, ""Ọ bụ ihe nwute n'ihe gbasara Sisiku Ayuk [Tabe] na mmadụ iri anọ na ise ndị achụgha chịrị na mba Kameruun n'izuka."" Anwụchiri ndị a n'Abuja n'abalị ise nke ọnwa Jenụwarị. Kameruun kpọrọ ndị a ""ndị na-eyị ndụ egwu"" ma kwuo na ha ""ga-azara ọnụ n'ime mpụ ha mere"" dịka enwere oke ụjọ na mpaghara Kameruun ndị na-asụ bekee. Ndị a emela mkpesa gbasara mmegbu ha na-ahụ n'okwu akụ na ụba na mba Kameruun. Ayuk Tabe chọrọ ka ha kwapụ site na mba Kameruun mgbe ndị otu ahụ kwuputara nwere onwe ha n'ọnwa nke afọ gara-aga. Ndị UNHCR kwuru na mmadụ iri anọ na asaa ndị a degara mba Naịjirịa akwụkwọ maka ihe izendụ. Ha chetara mba Naịjirịa iwu mba ụwa niile megidere ịchụpụ n'ike ndị bịara izendụ ma gwa ha ka kwụsị agwa ahụ. Ndị otu a chọrọ nwereonwe kwuru na-aha chọrọ ka Gọọmenti Kameruun kwuo ihe mere onye ndụ ha bụ Ayuk Tabe kamgbe anwụchiri ya na ndị ọzọ n'ọnwa jenụwarị. ""Anyị chọrọ ihe ga egosi na onye ndu anyị ka-adị ndụ."" dịka onye ode akwụkwọ mpaghara ndịda Kameruun bụ Chris Anu kwara BBC. Onyeisi ala mba Kameruun bụ Paul Biya na-ebu agha megide ndị chọrọ nkewapụ, ebe ojirila ndị agha wakpo ha ọtụtụ oge, tinye ọchịchị ọdịrịụkọ, ma machie ha ime njem. Ihe ndị ịkwesịrị ịma gbasara Paul Biya Naịjirịa na Kameruun nwere esemokwu gbasara oke ala Bakassi Peninsula. Ugbua ị dị na nma ha malitere kamgbe ha bidoro buwa agha megide ndị otu na-eyị ndụ egwu bụ Boko Haram n'agbata mba abụọ ahụ. Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ nke a mere ndị orụ nchekwa Naịjirịa jiri nwụchịe Ayuk Tabe ma were ya nye mba Kameruun." afirika-52953382,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52953382,Coronavirus Test: Ihe a ga-eme iji wulite nyocha maka coronavirus n'ala Igbo,Ụnyahụ bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa June ka onyeisi Nigeria Centre For Disease Control bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na o nweghị ka ndị bi n'ala Igbo ghara inwe mgbalite ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus maọbụrụ na-eme nyocha zuruoke.,"O kwuru na nke a bụ maka na ndị Igbo bụ ndị na-emekarị njem. Mana gịnị na-akpata emeghị nnyocha zuruoke maka covid-19 n'ọwụwa anyanwu? Dkta Mcginger Ibeneme bụ , onyeisi 'Isolation Centre, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospital, Nnewi, kwuru na o kwetaran'ihe onyeisi NCDC kwuru. O kwuru na ọtụtụ ndị na-akpọ ụlọọrụ NCDC na-agwa ha na ha na-ahụ ihe na-egosi na ha ebutela ọrịa ahụ, mana ụfọdụ oge ha kpọọ ụlọọrụ NCDC nke steeti o nweghị onye ga-atụpụrụ ha ọnụ. ""A naghị agadị eme ha nnyocha."" O kwuru na steeti dịka Ebonyi na-enyocha mmadụ ruru 100 kwa ụbọchị makana ha nwere ebe nyocha na steeti. Ihe a ga-eme iji wulite nnyocha maka covid-19 na mpaghara Ọwụwa Anyanwu Mcginger kwuru na: Mbọ niile anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị kọmịshọna ahụike steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwu kpụrụ n'ala makana ha azaghị ekwenti ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 54919729,https://www.bbc.com/igbo/54919729,Jerry Rawlings: Ezinaụlọ ya ekwupụtabeghị ihe gburu ya,"Dịka akụkọ gbasara ọnwụ onye chịburu mba Ghana bụ Jerry Rawlings pụtara n'ụbọchị Tọzde, ọtụtụ akụkọ na-efegharị ugbua gbasara ọrịa gburu ya.","Jerry Rawlings Ọtụtụ na-ekwu na o butere ọrịa coronavirus nke mere ka ọrịa ọ na-arịabu kawanye njọ. Akụkọ ndị ọzọ na-ekwukwa na ọ bụ obi mgbawa, nke Bekee kpọrọ 'heart attack' gburu ya. Mana ozi si n'aka ndị ezinụlọ Rawlings ekwughị kpọmkwem ihe gburu ya, kama ha kwuru na ọ nwụrụ dịka ọrịachara obere ọrịa. Ha rịọkwara ka onye ọbụla nyetụ ha ohere ka ha ruo uju nna ha. Ozi si n'aka ezinụlọ Jerry Rawlings Ihe ndị ọchịchị Afrịka kwuru maka ọnwụ Jerry Rawlings Dịka Igbo si atụ n'ilu, oke osisi daa, ụmụ nnụnụ ehu n'ime ọhịa. Ọnwụ Jerry Rawlings bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'Afrịka niile n'ụbọchị Tọzde nke mere ka ozi iti aka n'obi si n'elu na ala na-abịara ndị ezinụlọ Rawlings. Lee ihe ụfọdụ ndị ọchịchị Afrịka kwuru maka dike a: Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ gaghị adị mfe ịhụ onye ọchịchị ọzọ dịka Rawlings n'Afrịka: Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah kwuru na Rawlings gbara mbọ iweta udo na mba ha: Atiku Abubakar bụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru na Rawlings bụ dike Afrịka ji eme ọnụ, onye gbara mbọ maka ịdịnotu n'Afrịka: Bukola Saraki bụbu onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kwuru na Jerry Rawlings bụ onye okwu ọnụ ya na omume ya bụ otu ihe: Onye bụ Jerry Rawlings? Jerry Rawlings chịrị Ghana site 1981 to 2001 Jerry Rawlings weghaara ọchịchị n'ike na mba Gana ugboro abụọ tupu o nyefee ọchịchị n'aka ndị nkịtị Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya Nke mbụ ọ gbalịrị weghaara ọchịchị n'ike, a mara ya ikpe ọnwụ mana ọ gbapụrụ were kwaduo ọchịchị ndị agha na mba ahụ. Ka afọ abụọ gachara, Rawlings kwaturu onyeisiala a họpụtara site na ntuliaka ma zọọ ọkwa onyeisiala merie. Na mbụ ọ bụbụ onye 'socialist', o webatara ohere azụmahịa enweghị mgbochi gọọmenti nke Bekee kpọrọ ""free market"" ma mekwa ka mba Gana sonye na mba ndị agha ha sonyesiri ike n'ịakpa udo nke otu United Nations. A mụrụ Jerry John Rawlings n'ACCRA n'abalị 22 nke ọnwa Juun afọ 1947. Nna ya bụ onye Scọtland, ebe nne ya bụ onye Gana. Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ 'Achimota Secondary School,' ebe o mere ọfụma n'egwuregwu Polo. Ụmụakwụkwọ ibe ya na-ahụta ya dịka anụntị nakwa onye anaghị atụ egwu ikwu uche ya. Jerry Rawlings na-agwa 'Armed Forces Revolutionary Council' na-akwado ya okwu na nso Accra n'afọ 1982 Tupu o rute oge e bugoro ya n'ọkwa ""flight lieutenant"" n'afọ 1978, Rawlings abụrụla onye tinyere ezi uchu n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị. Gana , mba mbụ nwere onwe ha site n'aka Briten na-enwe nsogbu ụkọ nri, oke ọnụahịa nakwa ọnọdụ ndakpọ akụnaụba. Rawlings zisara iwe ya n'ihe ọ hụrụ dịka mpụ , nrụrụaka nke ọchịchị ndị agha mgbe ahụ. Oge a maghara mmachi etinyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1979, Rawlings ritere mmerị dịka onye a ma ama na-akatọ gọọmentị, ma na-ekwu ka ha mee ihe ga-enyere ndị ogbenye aka. Ọ bụ nke a gbara ya ume ịgbalị iweghara ọchịchị n'ike n'afọ 1979. Mbọ ahụ kụrụ afọ n'ala, e jide ya ma ma ya ikpe ọnwụ. Mkpocha na nzacha Rawlings si n'ụlọmkpọrọ gbapụ dịka ndị agha ndị obere na ndị ọzọ nyere ya aka. O chụdara onyeagha bụ onyeisiala mba Gana bụ Generalụ Fred Akuffo. O weghaara ọchịchị dịka onye ndu otu ndị agha 'Armed Forces Revolutionary Council"" (AFRC), nke kpalite otu akwụkwọ akụkọ mba Briten jiri ya mee isiakụkọ ha sị, ""Onye bụ ọkara onye Scọt na-egwu egwuregwu polo ewegharala ọchịchị na Gana"". Jerry Rawlings n'afọ 1987 Otu agha ""AFRC"" n'oge ọchịchị ya ṅụrụ iyi ijide ndị niile chịarala ọchịchị na mba ahụ ka ha zara ọnụ ha, nke mere ka ha gbuo Akuffo na ndị ọchịchị ndị agha ndị ọzọ. E gburu ọtụtụ ndị ọkpaikpe nakwa ndị agha nwere agba n'oge ahụ. Kama ijisi ọchịchị ike, Rawlings haziri ntuliaka ka ọ gachara naanị ọnwa anọ o jiri kwadaa ọchịchị ndị agha. Otu pati 'People's National Party' nke Hilla Limann bụ onye ndu ha batara n'ọchịchị. Ọtanisi Mana, ọtụtụ na-ahụta Liman dịka mmaṅwụ Rawlings na-akwa aka. Ọnyụpa ọ gbara na ịtụgharị ọnọdụ akụnaụba mba Gana mere ka ọchịchị ya bịa na njedebe. Ụgwọ Gana ji mba ndị ọzọ gbalitere karịa, ọnụahịa ihe na-ada nke Bekee kpọrọ 'inflation rịrị rue pasent 140., iwena ọnụma so ya butere ọgbaghara. N'abalị 31 nke ọnwa Decemba afọ 1981, Rawlings weghakwara ọchịchị n'ike nke abụọ ya nke webatara ọchịchị ọhụrụ, nke otu ""Provisional National Defence Council"" (PNDC), nọ n'isi ya. PNDC nke Rawlings bụ onye ndu ya gbaliri iweghachi Gana n'ọchịchị ebe gọọmenti na-ahazị akụnaụba nakwa ihe e ji emepụta akụnaụba nke Bekee kpọrọ 'maxist state'. Ọ dịka Rawlings nwere nghọta na otu Soviet Union na-achọ kpụ afọ n'ala, o were zọpụ ụkwụ ịgbaso atụmatụ ihe-ahịa- kwuru- sị-ree.(free market.) O wedatara ihe ego Gana n'ada n'ahịa, kwụsị iwe ndị ọrụ n'ọrụ gọọmentị, na resị ndị nkịtị ụlọọrụ gọọmentị nwechara nke gụnyere ugbo koko na kọfị. Mmeri were anya Na agbanyeghị na mgbanwe o wetara tọrọ Ụlọakụ mbaụwa bụ International Monetary Fund(IMF), na ndị mba mepere emepe (West) ụtọ, ọtanisi so ya butere ọgbaghara n'ụlọ. Bido afọ 1983 rue 1987, ndịe nwere ndị gbalịrị ịnapụ Rawlings ọchịchị n'ike. Ihe kachasị mebie okwu nụ mgbe e nyere ọtụtụ ndị Gana bi Naijiria ọsọ. Rawlings meriri ntuliaka onyeisiala ugboro abụọ doro anya Mana ka a banyere mmalite agbata afọ 1990s, mgbanwe o wetara bidoro mitawa mkp.ụrụ ọma dịka ọnọdụ akụnaụba Gana dịara mma.. N'afọ 1992 o meriri na ntuliaka onyeisiala mba Gana. O meriri mmeri were anya dịka o nwetara vootu 58% n'ime ihe a tụkọtara na ntuliaka ahụ nke 'Commonwealth' nakwa otu ""Organisation of African Unity"" kwuru na o nweghị nrụrụaka dị ya. O merikwara ọzọ n'ụzọ were anya n'afọ 1996. O welitere etu e si ahụta mba Gana na mba ụwa dịka Gana na-esiga ndị agha ha maka ọrụ ịkpa udo ọkachasị Liberia, Sierra Leone, Lebanon nakwa Iraq. N'afọ 2001, ka ọ chịchara agba nke abụọ ya, Rawlings mere ihe ahụbeghị onye ndu n'Afrịka mere ya, itinye akwụkwọ arụkwaghịm n'ọchịchị. N'ụwa mgbede ya, Rawlings na-ekwu pụta kaa a kpagbu ụgwọ mba dị n'Afrịka ji na mba ụwa. N'afọ 2010, e mere ya onyennochiteanya 'African Union' na mba Somalia. Ihe e ji e cheta Rawlings dị na ndabe na ndebe; ndị ihe ya anaghị amasị na-ebo ya ebobo mkpagbu nakwa nrụrụaka mana ndị hụ®ụ ya n'anya -na-ahụ ya dịka onye wetara udo, nchekwa na ọganihu na mba Gana nke mere ọtụtụ ndị Gana na-akpọ Rawlings ""obere Jeszọs"" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:" afirika-48540623,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48540623,Caf Champions League: Akagbuola mmeri Esperance meriri Wydad,"Ka a ka na-ekwu nke ha mere, ngalaba na-ahụ maka egwueregwu bọọlu n'Afrịka bụ Confederation of African Football (Caf) akagbuola mgbacha Iko African Champions League nke otu egwuregwu Esperance nke Tụnịshịa ji otu ọkpụ merie Wydad Casablanca nke Moroko n'ihi ọgbaghara.","Esperance natara mmeri ka ndi CAF gbubiri asọmpị ahụ Cheta na Casablanca sara ọkpụ goolu enyere ha mana onye na-egbu asọmpị ahụ kagburu ya , nke mere ha ji sị na ha agaghị agbazi asọmpị ahụ, ọkachasị mgbe achọpụtara na igwe VAR ga-ekwu ma nkagbu ahu ọkwụ ọtọ adịghị arụ ọrụ. Lee otu o siri mee ebe a: Ndọrọndọrọ goolu akagburu echiela Afrịka ọnụ n'ala n'asọmpị ngwụcha CAF Ndị egwuregwu Wydad sị na ogbu bọọlụ ga-ejiriri igwe VAR nyocha goolu ha akagburu Ugbua, Caf sị na a ga-agbagharị asọmpị ahụ ebe ọzọ agaghị abụ Moroko maọbụ Tunisịa. Na nkọwa ha, Caf sị na ọkpụ otu agbara n'agba nke mbụ na Moroko ka kwụ. Akụkọ si na agwaghị ndi na-agba bọọlụ na ihe a Bekee kpọrọ 'video assistant referee system' (VAR) anaghị arụ ọrụ A ga-agbagharị asọmpi a ma agbachaa Iko Mba Afrịka ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị. Caf sị ""Ọnọdụ asọmpị ahụ agbara na Tunisịa enweghi nchekwa ndụ na ịgba bọọlụ kwụ aka ọtọ"" ma gakwa n'ihu nye iwu ka Esperance nyeghachi Iko ha ritere n'asọmpị ahụ." afirika-54995588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54995588,Igbo culture: Uru i nwere ike irite na nri na-eyi ndị mmadụ izizi Igbo na-eri oge gboo na taa,"Igbo nwere nri, nwekwa nri.","Mana o nwere nri ha na-eyi ndị mba ọzọ izizi n'anya ma na-ebukwa ụfọdụ isi mana n'anya ndi Igbo, ha bụ oke nri. Dịka ndị ihe nri na-enye na-ahụ dọọ anya siri kwuo, nri ndị a gụnyere akụ, akpankwụ, abụzụ, oke ọhịa na-edozi ahụ dịka ha na-enye 'protein' n'ebe ọ dị ukwuu. Lee ụfọdụ eri-amịcha-ọnụ Igbo na-eri: 1. Akpa Akpa na-enye 'Protein' A na-akpọ ya ""akpa"" maọbụ ""akpankwụ"". Ụfọdụ na-akpọ ya ""akpangwọ, ebe ndị ọzọ na-akpọ ya ""akalikpọ. Ndị ọzọ na-akpọ ya ""Ụvụvụụ"". E nwekwara ndị na-akpọ ya ""Apan nkorokoro"" maọbụ ""Egoro."" Bekee kpọrọ akpa ""red palm weevil"" mana aha sayensi nyere ya bụ ""rhynchophorus ferrugineus"". Akpa bụ ahụhụ a na-ahụkarị n'ugbo maọbụ n'ime ahịa. Ọ bụ mba dịga n'Asia dịka Vietnam, Cambodia, China, Loas gbasaa rue Yorup na Afrịka ebe ndị Igbo, ọkachasị ndị okenye na ndị bi n'ime obodo, kpọrọ ya nnukwu nri. Akpa na-adịkarị n'osisi nkwụ maọbụ ngwọ, akụoyibo mana ọ na-ebikwa n'ikpo ahịhịa ebe ọ na-anọ yie akwa. A ma akpa maka irigbu nkwụ maọbụ ihe ọbụla ọ banyere n'ime ya dịka akwa ya na-aghọ nje Bekee kpọrọ 'larvae'. Otu nne akpa nwere ike iyi akwa ruru 300 maọbụ 500. Ha na-eto ha na-eri ime osisi nkwụ ganye na ha erigbu osisi ahụ. Ọ bụ larva ahụ ka ndị mmadụ na-eghekpọ maọbụ nwere ya sie nri. Oriakụ Margaret Okere kọwara BBC Igbo na mgbe ochie, ndị okenye na-etinye akpa na mmiri hapụ ya nwa oge ka ọ rịgharịa na mmiri nke ha na-azara nye nwa a mụrụ ọhụrụ. Ọ sị oge gboo a na-eche na ""Nwa ọhụrụ ọbụla e nyere ya anaghị arịa ọrịa dịka kansa."" 2. Akụ Akụ maọbụ mkpu bụ ahụhụ si n'ezinaụlọ ụchịcha. A na-enwe akụ 'nwoke' na 'nwaanyị' nakwa 'ezenwaanyị'. Akụ na-adịkarị n'udummiri oge ọ na-apụta ihe ma mmiri zoo bụ oge ha na-ahapụ ebe obibi ha fega ebe ọzọ maka imekọrịta na ibido ezinaụlọ ọhụrụ. Ụfọdụ agbụrụ gụnyere ndị Igbo na-ahụ akụ dịka nnukwu nri. Ụfọdụ na-ata ya na ndụ, ụfọdụ na-eghe ya eghe, ebe ụfọdụ ji ya esi ọkpa maọbụ nri ọka. Ụfọdụ na-ata ya na ndụ, ụfọdụ na-eghe ya eghe, ebe ụfọdụ ji ya esi ọkpa maọbụ nri ọka. Ụzọ ọbụla i siri sie ya, akụ bụ nri na-atọpu isi. Ụzọ ọbụla i siri sie ya, akụ bụ nri na-atọpu isi. Mana akụ bụ nsogbu nye ọtụtụ dịka o nwere ike imebi ihe a kọrọ n'ugbo maọbụ mebie ụlọ na ewumewu ndị ọzọ dịka ha nwere ike ịwakpo ụzọ,oche na tabulu gị. 3. Abụzụ Bekee kpọrọ ya 'cricket'. abụzụ bụ nri ọzọ Igbo ji emegharị ọnụ. ụfọdụ na-ahụ ya n'ọkụ, ebe ụfọdụ na-eghe ya eghe. Mana ọ bụghị naanị Igbo na-eri abụzụ. Mba dị na mpaghara Asia ejighị ya egwu egwu dịka ha ji ịzụ ya maka oriri kpọrọ nnukwu ọrụ. Dịka otu 'Food and Agriculture Organization' siri kwuo, abụzụ nweere 'protein' ọfụma, vitamin,faiba, caalcium, potasium na akọọngwa ndị ọzọ na-edozi ahụ. 4 . Ụkpana Ụkpana bụ oke nri ndị Igbo na-eri. N'oge Agha Biafra, ụkpana bụ nnukwu nri eji edochi anụ n'ihi oke ụkọ anụ. Mana ugbua, ọtụtụ agbahapụla ya, naanị ụmụaka ka ji ya emerụwa ụbọchị n'ala Igbo. 5.Oke ọhịa Oke ọ ga-agọpụli onwe ya na ebubo a? Oke na ọsọ, ngwere n'ụzọ bụ okwu ma bụrụkwa ụka. Ndị Igbo ejịghị oke ọhịa egwu egwu dịka ha na-eji ya esi ofe maọbụ tagharịa ọnụ. Ụfọdụ ka na-eri ya ugbo n'ime obodo. Kedụ ihe a na-erite na nri ndị a? Dọkịta Florence Uchendu nakwa Amaka Ezeoke bụ ndị nri nakwa ihe ha na-enye n'ahụ doro anya(nutritionists) kwuru na nri ndị a bụ ezigbo nri nwere ike ịnọchị anya anụ n'ihi na ha nwere 'protein' n'uju. Ezeoke sị, ""Ọtụtụ nri ndị a anyị na-eleghara anya nwere 'protein' ebe ọ dị ukwu. ""Ọ bụrụ na i tinye ya nnụ, tinye ya ose na mmanụ, tinye ya vitamins inweta ezigbo nri. Nnu nwere iodine,ose nwere vitamins."" Ha tụrụ aro iji ya tikwa nri dịka osikapa, akamụ nri ọka nakwa nrị ndị ọzọ iji nweta ihe ndị na-edozi ahụ zuru oke. Uchendu kwuru na e nwere ike ighekpọ akụ, kwọọ ya ma gba ya na mkpọ ma na-etinye ya n' akamụ maọbụ were ya mee ịsha n'osikapa jọlọf. Ugbua ịzụta anụ dịzị ka ịgba akwụkwọ njem mba Amerịka, ọ bụ na o rubeghị oge ndị mmadụ ga-ebido kọwa ugbo ụfọdụ 'anụ' ndị a na-eleghara anya? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44309273,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44309273,Buhari na Super Eagles nwere ọgbakọ taa,Onyeisiala Muhammadu Buhari zutere ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles n'isi ụlọ ọrụ Naịjirịa n'Abuja taa.,"Nzụkọ a bụ otu n'ime ihe ndị Super Eagles ji akwado ọpụpụ ha ịga Rọshịa ebe a na-asọmpi iko mbaụwa afọ a bụ 2018. Ụlọọrụ onyeisiala nọ n'akara ha na Twitter taa gosipụta etu ya bụ ogbakọ siri gaa. End of Twitter post, 1 Onyeisi ụlọọrụ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick gwara onyeisiala na ndị nọ na Super Eagles na-aga Rọshịa bụ ndị e hiri asaa n'anya wee họpụta. Pinnick kwuru na ga-emepụta Naịjirịa ihu, ebe o kelere onyeisiala maka ohere o nyere ha ịhụ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45782804,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45782804,Akụkọ kachasị n'abali a: Igbo achọghị osote onyeisiala - Ipob,IPOB etiila mkpu ọzọ,"Ipob ekwuola na ihe ha chọrọ abụghị ka onye Igbo bụrụ osote onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2019 dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ugbua. Ha kwuru na ndị na-ekwu ihe a bụ ndị ihere nye ndị Igbo. Ha kwusiri ike na sọsọ ịnwete ala Biafra bụ ihe kachasị ha mkpa. Nnai Nwodo ekwuola ebumnuche Ohaneze gbasara ntuliaka 2019 Onyeisi Ohaneze ndi Igbo bụ Nnai Nwodo agwaala BBC Igbo na onweghị onye ha na-akwado ugbua maka ntuliaka 2019. Mana o kwuru na onye Ohaneze Ndigbo ga-akwado ga-abụ onye kwenyere n'atumatu Bekee kpọrọ ''restructuring''. Nikki Haley etinyela akwụkwọ arụkwaghị m N'ofesi, Nikki Haley bụ onye na-anọchịte anya mba Amerika na n'otu jikọtara ụwa akpọrọ ''United Nations'' etinyela akwụkwọ arụkwaghị m. Haley banyere ọkwa a n'afọ garaaga ekwubeghị ihe mere o ji tinye akwụkwọ a. Onyeisi ala Amerika bụ Donald Trump kwuru na ya ga họpụta onye ọzọ ga-anọchite ya anya n'ime izuka n'abia. Senegal ga-anabata ụwa n'asọmpị Olympics ntorobia N'egwuregwu, ngalaba na-ahụ maka asọmpi olypics ahọpụtala mba Senegal dịka mba ebe ha-ago sọ mpi olympics nke ndị ntorobia nek afọ 2022. Senegal bụ mba nke mbu sị mpaghara Afrika ga-anabata ụwa n'asọmpị a. Gee nkeji nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala? Nnia Nwodo gara iriji na Saụt Afrika Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Ụnụ ejila ọgụ egbo ọgụ, bụ okwu Nnia Nwodo, onye ndu Ohaneze Ndigbo gwara Ndigbo. Nwodo kwuru nke a n'olu onye nọchitere anya ya n'emume iri ji Ndigbo na Saụt-Afrika na nsonso a. Ụbịam ọnụ ntụ abịala Alaigbo Naịjirịa so na mba ụbịam ji aka na mba ụwa Ụnụ anụla e, a gụnyela Ebonyi n'ebe ụbịam ọnụ ntụ kachasị na Naịjirịa. Otu mbaụwa,United Nations Development Programme (UNDP) sị na ndị Ebonyi Sokoto, Jigawa, nakwa Rivas steeti bụ steeti ndị kacha daa ogbenye na Naịjirịa. Donald Duke atọọla aka na nti maka Naijiria ịgba mbibi China Donlad Duke chiburu Cross River Steeti site na 1999 - 2007 Donald Duke bụ onye bu ọkọrọtọ ndị otu SDP na ntuliaka 2019 adọọla aka na ntị maka oke ụgwọ Naịjirịa na-ekonye onwe ya n'isi site mba China na mba ndị ọzọ. Duke sị na ịgbazite ego na mba ofesi na egbu obodo a, nakwa na ọ ka mma ịhazị ụlọakụ Naịjirịa n'ụdị ga-enyere ha aka ibinye obodo ego na-agbaghị ọbara. Super Eagles - Ọ ihe bụ ụkwụ nama ji eje Umuahia? Super Eagles kwesiri ịmalite nkwado African Campionship n'izu a. Obi na-amapụ ndị Nigeria Football Federation (NFF) ebe ọ bụ naanị mmadụ atọ ndị Super Eagles batarala maka nkwado asọmpị ha na ndị Libya ga-enwe na Uyo ụbọchị Satọde na-abịanụ. Gee nkeji nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala? Akụkọ ga-amasị gi" afirika-48673805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48673805,"House of reps' alleged vote-buying : Ahụrụ m ""green Mastercard"" mana amaghị mka ego a dị na ya - Hon. Yakubu Barde",Onye nnochiteanya Chikun/Kajuru n'Ụlọomeiwu Nta bụ Hon. Yakubu Barde ekwuola na ya huru mpekele akwụkwọ ndụ e ji a dọrọ ego e dere(Green Mastercard) aha Gbajabiamila na ntuliaka ndị ụlọomeiwu Nta mana ya amaghị ka o nwere ike ịghọ ego.,"Ọ sịkwa na Femi Gbajabiamila na onwe ya agọnahụghị ya bụ mpekele akwụkwọ ndụ mana ọ sị na ""ọ bụ ihe onyinye"". Barde sịkwa na ya hụkwara ka ndị otu ha na-ese ya bụ mpekele akwụkwọ ndụ edowere n'elu akwụkwọ ntuliaka ha foto mana ya amaghị ihe butere nke a. O kwukwara n'ezie na ya bụ akparamaagwa were ike ime ka enyowa ya bụ ntuliaka enyo mana kemgbe onwe onye e ji aka, ọ ka bụ ihe efu. N'uche ya,""o nweghị ihe o mere na mmadụ sere foto iji gosi nkwado, mana ọ bụrụ na-amanyere onye ahụ amanye na ụdị na-aga ata ya ahụhụ ma o meghị otu ahụ, ebe ahụ ka nsogbu dị"". Barde sịkwa na iwu Inec emetutaghị ntuliaka ahụ, na ha mere ya dịka ndị nnọchiteanya ahụ sị chọọ. Ọ sị: Ahụrụ m ""green Mastercard"" mana amaghị m ka o nwere ka ego ji si n' aka fere aka. Mana ọ bụrụ na nke mere, ọ jọgburu udele ma sigbo nkakwụ"". Ndị nnọchiteanya Ndigbo anyị kpọrọ achọghị itụpuru BBC Igbo ọnụ maka nke a. Akụkọ ga-amasị gị: Lee ihe nkiri Ndị Igbo na Naịjirịa: Ihe Abaribe kwuru maka ọnọdụ ndị Igbo na Naijirịa" afirika-44648157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44648157,Ogbaghara APC Imo: Aka Okorocha ọ dị na nsogbu ndị omeiwu?,Ọnụ na-ekwụchitere Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo agọọla akụkọ kwuru na aka Okorocha dị na ihe na-eme na ọlụ omeiwu nke Imo steeti nke mere ụfọdụ ndị omeiwu enyere ezumike ike ji bo ya ebubo na ọ bụ ya bụ osisi dachiri ha ụzọ.,"Okorocha achịịla Imo steetị agba abụọ Ebubo na-ekwu na nsogbu ndị omeiwu a ezumike ike a metụtara bụ ndị akwadoghị atụmatụ na ọgọ Okorocha bụ Uche Nwosu ga azọ oche gọvanọ Imo steeti na ntụlịaka 2019 na okpuru All Peoples Congress (APC). Onwuemedo gwara BBC Igbo n'elu ekwenti na onweghị oge Okorocha maọbụ gọọmenti ya jiri tinye aka n'ihe na-eme na ụlọ omeiwu nke Imo steeti. Onwuemeudo kwukwara na aka Okorocha siri ike n'ime ọchịchị APC na steeti ahụ na kwa na udo abataala n'otu patị ahụ n'ime Imo. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ebubo a niile bụ asị. ""Ndị a niile bụ ndị nwere ebumnobi ịbụ gọvanọ mana obi dị ha njọ maka na Okorocha akwadoghị ha."" O kwusiri ike na onweghị ntụlịaka imeụlọ ọzọ ga-eme na Imo steeti makana ndị Imo na-akwado ọgọ Okorocha. Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na onye bụbụ kọmịshiona mgbasa ọzị Imo steetị bụ Theodore Ekechi nwere, o kwuru na Okorocha na-achụ ndị mmadụ na-eleghị anya n'azụ. Ekechi kwetakwara na a gaghị eme ntụlịaka imeụlọ ọzọ na steeti ahụ maka na ha eduola ndị isi ọrụ pati ha n'ọrụ. Ekechi kwusiri ike na ọ bụ ihe ihere na Okorocha na ndị ọnụ okwu ya ka na-agọ njọ niile ha mere. Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Mgbechi Onyedika bụbụ otuu n'ime ngalaba a kpọrọ 'Transitional Council of Ngor Okpala' na Bekee gwara BBC Igbo na Okorocha chụrụ ya maka na ya bụ onye ama ama dịka onye na-akwadoghị ọgọ ya nwoke. Onyedika bọkwara ebubo na ha ka ji ya ụgwọ ọnwa ise. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57005547,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57005547,"Eji m egwu Egara achụ ndị mmadụ obi ịdamba, ọbara mgbalielu na obi mgbawa - Ada Egara Nsukka","Dịka omenala Igbo ji ọsịsọ ala n'ụfọdụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Blessing Chidiebere Emmanuel chọpụtara ụzọ ọ ga-esi mee ka egwu Egara ka nọdụsie ike.","Ọ sị na ọ bụ ka di ya nwụrụ n'afọ 2017 ka ya malitere ịgụ egwu Egara iji kasie onwe ya obi. Ọ sị na oge ọbụla ya hụrụ onwe ya n'ọnụdụ ahụ, ya agụwa egwu Egara, nke mere ka ndị mmadụ na-akpọ ya ka ọ gụọrọ ha ya bu egwu. Ugbua, ọ na-aga ebe mmemme agụrụ ndị mmadụ egwu Egara. Lee etu o siri kọọ akụkọ ya. Ndị mere akụkọ: Chris Okereke, Chiemela Peters na Vining Ogu." media-49199448,https://www.bbc.com/igbo/media-49199448,Real Estate: I nwere ala? Lee ihe ọ ga-eri gị ịrụ ụlọ ma i nwee nde naịra ise,"Dịka otiegwu Igbo a ma ama bụ Oliver de Coque siri gụọ n'egwu, ekpere nwa afọ Igbo ọbụla bụ ""ka ọ rụọ ụlọ nke ya.""","I nwere ike iji nde naira ise(N5m) rụta ụlọ ala dị mma Ịrụ ụlọ bụ egwu ndị ọ kara obi n'ihi na ọ dịka ịchị ụtaba n'aka na-agba egwu. Mana ọ bụ ebe aka rụrụ nwaanyị ka ọ na-ekonye di ya n'ihi na i nwee ala ma jidekwa ihe dika nde naira ise (₦5million), ị ga-enwe ike ịrụta ụlọ ị ga-akpọ nke gị. Na nkọwa ya ọkachamara n'ihe ewumewu nke Bekee kpọrọ 'Architecture' bụ Obinna Ogbuokiri kọwara BBC Igbo na onye nwere ala ma jide nde naira ise nwere ike iji ya rụta ụlọala. Ụlọahụ ga-e nwe; ọnụụlọ atọ maọbụ anọ; ebe nnabata ọbịa; ebe erimnri; usekwu na ụlọ mposi n'ime ya. Ego ahụ zukwara gị ịgba ya bụ ụlọ ngwuru (fence), ma gbapuo mmiri (borehole). Lee ihe ndị ọ ga-eri gị dịka Obinna, onye nwe 'Cartouche Shelter Limited, Owerri' siri kọwaa: Ọ ga-erị gị akpa siment 400 ịrụta ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ Ngwongwo na ngwongwo: 1. Okporoigwe( (12mm by 12 mm) ₦2,200 x okporo 100 = ₦220,000 2. Akpa Simenti - 400 x ₦2500 = ₦1,000,000 3. Blọk @5000× ₦40 = ₦200,000 4. 'Tipper' aja ọcha - 12×₦15,000 = ₦180,000 5. 'Tipper aja ụpa (laterite) 20 trips× N7,000 = ₦140,000 6. Ịwa ntọala ụlọ n'ọnụ N500×50 partitions = ₦25,000 7. Ego ọrụ (Workmanship) n'ọnụ ₦40×5000 blọk = ₦200,000 8. Osisi e ji akụ elu ụlọ = ₦500,000 9. Gbamgbam( stoned-coated aluminium) =₦ 1, 200,000 10. Ọnụ ụzọ @ 7x 20,000 = =₦140,000 11. Mpio (Aluminium Window) - 10x N22,000 = ₦200,000 12. Ite aja (Plastering) = ₦100,000 13. Uhie na ite uhie = ₦250,000 14. Sink @ 3x N5000 = ₦15,000 15. Water Closet = ₦15,000 16. Akọrọngwa latrik na itinye ya = ₦200,000 17. Ịgbapu mmiri(borehole) = ₦120,000 18. Ido ngwuru (fencing): = ₦800,000 O ga-eri gị 'trip' aja ruru 50 Usoro ị ga-agbaso na ihe ọ ga-eri gị: 1. Mbido Ihe mbụ onye na-arụ ụlọ ga-eme bụ ilezi anya mapụta ntụzi eserese ụlọ ahụ n'ala ebe a chọrọ ịrụ ya. Ogbuokiri kwuru na ọ bụ n'oge a ka a ga-eji osisi a kpodoro n'ala mapụta ọnụ ụlọ dịka o si dị n'akwụkwọ iji doo anya ka a ghara inwe nghotahie ọbụla. 2. Ịkpụ blọk I nwere ike ịkpụ blọk maọbụ zụrụ nke a kpụrụ akpụ. Ọ ga-ewe ihe dịka blọk puku ise maọbụ puku asaa irụta ụlọ ala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ. Ndị ọrụ ụlọ doro anya kwuru na mmadụ iji aka ya kpụọrọ onwe ya blọk na-aka mma karịa ịzụ nke akpụrụ akpụ. Mana ọ bụrụ na ọ dị gị ọsọ ọsọ i nwere ike ịzụ blọk gị. Ogbukiri dụrụ ọdụ ka ị zụrụ ya n'aka ndị nwere igwe na-akpụ blọk n'ihi na ''nke ha na-esi ike."" Ọ dọkwara ndị mmadụ ji aka ha akpụrụ onwe ha blọk aka na nti banyere ịkpụ blọk n'udummiri. ""mmiri nwere ike izo mebie blọk a kpụrụ akpụ."" 3. Ị wa ntọala ụlọ Dịka Ogbuokiri siri rụtụ aka, a na-awa ntọala n'ibe n'ibe nke ndị ọrụ ụlọ kpọrọ 'partitions.' Iru ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ ga-eri ihe dịka 'partitions iri ise nke ọ kọwara e ji ihe dịka narị naịra ise maọbụ isii egwu. O nwere ike dakarịa ma ọ bụrụ ala siri ike maọbụ ala okwute. Ceilings E gwucha ihe ndị a aga agwa aja, okwute na simenti were wụọ ala ahụ e gwuru rute n'ogogo a kpọọ 'damp proof course' na bekee ma were akpa wakịrịwakịrị kpuchie ya. Nke a bụ iji gbochie miri si n'ala idebata n'ahụ aja ụlọ ma a rụchaa ya. Ndụmọdụ ọzọ Ogbuokiri na-eneye onye na-arụ ụlọ bụ ịgba mbọ hụ na ọ wulitere ala ụlọ ahụ ka ọ karịa ogogo okporoụzọ iji gbalahụ ide ịwabata n'ụlọ ahụ. Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium 4. Iwulite rue ogogo 'lintel' Ọ bụ ogogo blọk itoolu maọbụ iri ka a ga-edo site n'ogogo 'Damp Proof Course' were rute ogogo 'lintel' bụ ebe itinye ọnụ ụzọ na windo. Ọ bụ n'oge a ka a na-eji okporo igwe rụkọta blọk na-ejịkọta ụlọ ahụ ọnụ; ma ụzọ, windo na aja. 5. Ido Elu ụlọ Iji 'tiles', 'marble' maọbụ 'granite' bụ ka akpa onye ha. OỌ kara onye ji naanị nde naira ise mma iji 'tiles' n'ihi na ndị ọzọ ka ndị ọnụ ahịa I dochaa 'lintel', ọ ga-eri gị ogogo blọk atọ idorute elu ụlọ ala ebe o kwesiri, dịka Ogbukiri , onye bụkwa onye nkuzi ' 'Architecture' na 'Federal Polytechnic, Nekede', Owere. "" Ọ bụ ebe ka ị ga-arụ 'concrete facial' nke ndị mmadụ ji 'parapet"" mara. Ọ na-ewu ugbua n'ihi na ha ji ya achọ ụlọ ahụ mma."" Na nkọwa ya, ịrụ nke a nwere ike pụkụ narị naira anọ(N400,000). 6. Ịkụ osisi,mgbamgbam na ịdọnye ọnụụzọ na windo Ogbukiri: Ọnụụzọ igwe ndị Naijiria rụrụ na-aka mma karịa nke a tụbatara Ihe na-eso idolite ụlọ bụ ịkụ osisi nakwa mgbamgbam nakwa itinye ọnụụzọ na windo. Ogbukiri kọwara na 'aluminuim coated zinc bụ ụdị mgbamgba e jizi arụ ụlọ ugbua. Ọ gbakwara ama na ọnụ ụzọ igwe nke a rụrụ na Naijrịa na-aka nke e si mba China tụbata esi ike. Ihe na-eso ihe ndị a bụ ite aja, itinye akọrọngwa latrik, mposi,afere e ji akwọ aka na ụmụ kirikiri ihe ndị ọzọ nakwa ite uhie. Obi dị m ụtọ na m na-eme ihe nwoke na-eme- Nwaanyị na-ete ụlọ uhie Ọdachi isei kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ Ọdachi i kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ gị- Ọkachamara 1. Inye ndị amaghị nke a na-akọ n'ọrụ iwu ụlọ( ndị adịgboroja) ọrụ Enyela ndị adịgboroja ọrụ ụlọ gị . Ọtụtụ ụlọ na-ada ugbua bụ maka na e nyere ya onye ihe edoghị anya ka ọ rụọ. 2. Mee ntule ụdị ala ị chọrọ iwu ụlọ na ya Ụfọdụ ala agaghị ebuli ụlọala ebe ụfọdụ aghaghị ebuli ụlọ ala. Ọ bụ nnyocha ga-agwa gị nke bụ nke. 3.Nhazi ụlọ gị ọ dabanyekwara n'ihe iwu kwuru? Ogbuokiri rụrụ ọdụ sị, ""Ọ dị mkpa i wegara ngalaba na-ahụ maka ewumewu nke steeti ị na-arụ ụlọ, akwụkwọ were nata nkwado."" ""Emeghị otu a, ha nwere ike ịkụri ụlọ gị ma ị rụcha ya."" 4. Ndị 'Omonile' nwere ike iji gị n'ọrụ Na obodo ụfọdụ ndị ntorobia nwere ike inye gị nsogbu ka ịkwụta ha ụgwọ tupu iwu ụlọ gị. Nke a bụ omenala a na anụbu na mpaghara Naijiria ndị ọzọ mana ugbua nama abatala Ọka. 5. Gbalahụ iji akụrụngwa adịgboroja arụ ụlọ. Iji mee nke a Ogbuokiri sịrị na ọka mma ịhapụ onye ọrụ doro anya ka ọ zụọ akọrọngwa e ji arụ ụlọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49994229,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49994229,Sex for Grades: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya,Ọtụtụ ndị gụnyere ndị ntoroọbịa na ndị okenye akọwala ebumnobi ha banyere akụkọ ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha iji nye ha akara.,"N'ajụjọọnụ BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị mmadụ, ha gbarụrụ ihu kwuo na ụdị agwa jọgburu onwe ya. Otu nwata akwụkwọ sị n'agbanyeghi na nna ya bụ onye nkuzi na ndị nkuzi ibe ya na-akpị ya anya ka ọfọdụzie ndị nne ha ma ọ bụ nna ha na-abụghị ndị nkuzi. Onye nke ọzọ sị n'agbanyeghi na ụmụakwụkwọ na-achụ ndị nkuzi mgbe ụfọdụ, kama na ọ dị onye nkuzi ahụ n'aka ịgbọja ụmụakwụkwọ dị etu a. Ihe niile ha kwuru nọ n'ime ihe onyonyo a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42901158,https://www.bbc.com/igbo/42901158,Akwamozu Ekwueme: Ndị Igbo ji eme ọnụ kwuru okwu otito,"Ndị Naijiria ọnụ na-eru na okwu na otu dị icheiche gụnyere ndi ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ ugbo, ndị na-azụ ahịa,ụmụ akwụkwọ nakwa ọtụtụ ndị mmadụ yi uwe eji mara ha kpakọrọ n' Ekwueme Square, dị n' Ọka (Awka) ma naa-ekwupụta ezi ihe Chief Alex Ekwueme mere ka ọ dị ndụ.","E si Enugwu buru ozu Ekwueme bata n'ogige ahụ ebe uwe ojii mere ya ịkwụ na ahịrị ikpeazụ. Onye ntaakụkọ BBC bụ Ebere Ekeopara gara ebe ahụ jụrụ ndị mmadụ ihe mere Ekwueme jiri bụrụ ọpụrụiche. Nnia Nwodo, onyeisiOhanaeze Ndigbo: Chief Nnia Nwodo bu Onye isi otu jikotara ndi Igbo nile bụ, Ohaneze Ndigbo, kwuru na Chief Alex Ekwueme enweghị oyiri n' umeala, idi uchu na oru ma bụrụkwa onye eziokwu. Nwodo kwuru okwu a oge ndi agbata ndị ọwụwa anayanwụ jikoro aka ọnụ wee guzobe mmemme iji si Ekwueme gaa nke oma. Chief Ken Nnamani: Onye jibu okwa onyeisi Sineti n'ala Naijiria bụ Chief Ken Nnamani nyere ndị ala anyi ndumọdụ ka ha ṅomie ezi agwa Dr Alex Ekwueme nke mere ka puku kwuru puku mmadụ jiri gbakọ na Ekwueme Square taata(Tọsde) mmemme nkwanye ugwu na Ekwueme Square Awka. Ọ sịrị,""Onweghị ebe a na-akpọ ya na o riri ego."" Nnamani toro Ekwueme dịka nka nna restructuring nakwa zoned federalism." mba-uba-43021753,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43021753,Ụgbọelu danyere na Grand Canyon egbuola mmadụ atọ,Ụgbọelu bu ndị mmadụ na-aga nlegharịanya n'ebe a na-akpọ Grand Canyon na mba Amerịka dara wee gbuo mmadụ atọ n'ime ndị nọ n'ime ya.,"Ụgbọelu helicopter danyere n'ime Grand Canyon Ndị nwe ụgbọelu a bụ Papillion Airways. Akpọrọ udịrị ụgbọelu a Eurocopter EC130. Ndị na-ahụ maka Grand Canyon sị n'ụgbọelu a mebiri ọfụma mgbe ọ dara na nso ọdọ ụgbọelu. Onyeisi ndị uweojii na Hualapai Nation bụ Chief Francis Bradley gwara ndị ntaakụkọ ABC na mmadụ isii na onye na-anya ya nọ n'ime ụgbọelu a. Amabeghị ma onye nya ụgbọelu a o so na ndị nwụrụ anwụ. N'elekere itoolu n'ụtụtụ n'Amerịka, mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ ka nọ n'ebe ụgbọelu a dara, maka ọ rara ahụ ịrute ebe ahụ. Nnukwu ikuku na ọchịchịrị so mee ka ọ raa ahụ, maka na ọ bụ helicopter ka eji ebupu ndị a merụrụ ahụ." 45021686,https://www.bbc.com/igbo/45021686,Ebee ka Ekweremadu nọ ugbua?,Akụkọ na-erute BBC Igbo ntị bụ na ngalaba gọọmenti etiti na-ebu agha megide nrụrụaka nke a kpọrọ EFCC n'aha ịchafụ ji osote onyeisi Sineti bụ Ike Ekweremmadụ.,"Ndị niile BBC kpọrọ na-ekwe ntị ekweteghị na ha matara ihe ọbụla gbasara ozi a na-apụta. Mbọ BBC gbara inweta ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadụ bụ Uche Anichukwu amịtaghị mkpụrụ n'ihi na ọ zaghị ekwe ntị ya. Onu na-ekwuru Ekweremadụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Luke Mgboh kwuru na ya amaghị maka ya. Mana otu onye welitere isi na PDP onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na EFCC ji ya kemgbe ụtụtụ. N'okwu ya ọ siri, ""EFCC anwụchịghị ya kama ha kpọrọ ya oku maka ịgba ya ajụjụ ọnụ.' O kwukwara na-ha ji ya kemgbe ụtụtụ. Akụkọ ga-amasị gị" 42852457,https://www.bbc.com/igbo/42852457,Onyeisiala mba Rwanda abụrụla onyeisi AU ọhụrụ,Onyeisiala mba Guinea enyefela ọkwa onyeisi otu mba Afịrịka a na-akpọ AU n'aha ịchafụ n'aka onyeisiala mba Rwanda bụ Paul Kagame.,"AU bụ otu na-ejiko mba ndị nọ na mpaghara Afịrịka Kagame kpọkọrọ ndị otu AU niile ka ha nwee ịdị n'ọtụ n'etiti ha iji we nweta mgbanwe niile ha chọrọ na mba ha n'otu n'otu nakwa dịka otu mpaghara. N'aka nke ọzọ, onyeisiala Naịjirịa amalitela okwu gbasara isi okwu nzụkọ AU nke afọ a nke bụ ọgụ megide mpụ. Cheta na onyeisiala Buhari hapụrụ Abuja ụbọchị 26 Jenuwarị gawa mba Etiopia ebe a na-eme ọgbakọ ahụ. Buhari bụ onyeisioche gbasara ọgụ a na-alụso mpụ na mpaghara Afịrịka. Anyị ga na-ewetara gị akụkọ ka ọ na-aga" 43773293,https://www.bbc.com/igbo/43773293,Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria,"Akwụkwọ ahụ zịpụtara na a na-akwụ onye sinetọ ọbụla dịka ego ha na-emefu n'ịrụ ọrụ ha kwa ọnwa atọ gụnyere; nde naira 1.8 maka ịzụ akwụkwọ akụkọ, nde naira 10 maka ime njem n'ala Naijiria, nakwa nde naira 1.5 maka ilezi komputa.","Akụkọ oke ego ndị Sinetọ na-eri n'ụgwọ ọnwa agbara ọtụtụ ndị mmadụ iwe Agbakọ ya, ihe nke a pụtara na onye Sinetọ nwetara nde naira 1.8 million maka ịzụ akwụkwọ akụkọ ọnwa atọ na-azụ akwụkwọ akụkọ pụtara puku naira iri abụọ (20,000) kwa ụbọchị, ebe ọ na e mefu N111,000 kwa ụbọchị iji mee njem ụgbọala maọbụ nke ụgbọelu. Ego ndị ọzọ gụnyere akọrọngwa e ji arụ ọrụ, nde naira 3; ego maka ilezi ngwa ọrụ nde naira 1.6; izipụ akwụkwọ ozi (postage), puku narị naira ise (500,000); ile ọbịa nde naira 6.8 ; ibi akwụkwọ na ihe oriri, nde naira 1.4; akọrọngwa kọmputa, nde naira 2 na ilezi ụgbọala, otu nde naira. Dịka ụlọakụkọ Premium Times siri kọwa, ha nwetara akwụkwọ ahụ n'aka onye bụbu onye sinetọ bido n'afọ 211 rue n'afọ 2015 oge ndị ụlọomeiwu ukwu na-anata nde naira 45 ọnwa atọ ọbụla. Akwụkwọ ahụ nke a kpọrọ, "" Akwụkwọ nkọwa ka e siri mefuo ego' na-atupenye ndị Naijirai azụ banyere otu ndị Sinetọ si emefu ego ala anyị. Akwụkwọ a na-eso ama nke onye sinetọ si Kaduna steeti bụ Shehu Sani gbara na ndị sinetọ na-eri nde naira 13.5 kwa ọnwa, ozi nke butere oke iwe ọha ndị Naijiria na nso nso a. Shehu Sani gbara ama na ndị sinetọ na-eri nde naira 13.5 kwa ọnwa Agbanyeghị na akwụkwọ ahụ nke Sinetọ ahụ achọghị ka a kpọ aha ya n'ihi ịtụ egwu ihe ndị nddị Sineto ndị ọzọ maọbụ ndị na-akwado ya ga-eme ya, gosiri etu ndị ụlọomeiwu si agbarị ego anyị karịa ego ole nke ngalaba na-ahụ maka ihiwe ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmenti a nke a kpọrọ Revenue Mobilization Allocation and Fiscal Commission (RMAFC) na bekee ma bụrụ kwa ego a tinyerela na bọgeti nke ụlọoomeiwu. Dịka iwu siri kwuo, onye Sinetọ kwesiri imefu puku naira 202,640 na ịzụ azụ akwụkwọ akụkọ , nke a bụ otu ụzọ n'ụzọ iri ụgwọ ọnwa ya bụ nde naira abụọ( N2,026,400.00.) E lee ya anya nke ọma, nke a pụtara na ndị Sinetọ 109 natara ihe dịka nde naira 314 dịka ego ha mefuru na-mgbagharị ịrụ ọrụ ha nke a kpọrọ 'runnning cost' na bekee, site n'afọ 1919 rue afọ 2016 mma mefuo nde naira 53 kemgbe afọ atọ onyeisiala Muhammadu Buhari jiri banye n'ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe mbụ na akwụkwọ ahụ gosiri na sinetọ ahụ gbariri nde naira 45 na nje mba ofeesi, n'afọ 2012; nakwa nje n'ime naijiria nde naira 10, ebe nde naira 7.4 gara na ihe ndapụta nke a kpọrọ 'contingency' expenses' na a bekee. Ama gbara ụlọakụkọ Premium Times na a na-ele onye omeiwu anya iweta akwụkwọ ngosi ihe onye zuru(receipt) iji kwado okpookpo ego e depụtara. Ndị mgbaama kwuru na ọtụtụ ha na-eji akwụkwọ ngosi ihe onye zuru adịgboroja e me nke a n'ihi enweghị ezi nkọwa ga-akwaado oke mmefu ego ndị a, ma kọwa na 'omenala ka na-aga n'ihu rue ugbua." egwuregwu-43549321,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43549321,Naijiria Vs Serbia: Mikel Obi atụọla arịrị,"Obi adịghị kaptin ndị Super Eagles bụ Mikel Obi, mma maka na ọ gaghị eso gbaa bọọlụ asọmpi enyi na enyi nke dị n'etiti Naijiria na Serbia echi.","Mikel Obi gbaara otu Chelsea bọọlụ tupu ọ gaa Chaịna Mikel na-agba mbọ inweta akwụkwọ mba Chaịna ebe ọ na-agbara otu egwuregwu Tiajin Teda, bọọlụ. Nke a bụkwa ihe mere na o soghị n'asọmpi Naijiria na ndị Poland gbara n'izu gara aga. Mikel kwupụtara ka ọ dị ya n'obi gbasara asọmpi echi n'igwe okwu, 'Twitter' sị: ""N'ihi ọnọdụ m amaghị ka m ga-esi mee, agaghị m esonye n'egwuregwu anyị na ndị Serbia ga-agba echi. ""Obi dị m mwute, ike gwụrụ m, mana ana m enye ndị otu anyị nkwado m niile."" End of Twitter post, 1" afirika-44135621,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135621,Ọ bụ eziokwu na ọnụ ahịa ihe oriri dị icheiche agbadatala?,Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ akụnaụba obodo bụ nke akpọrọ National Bureau of Statistics (NBS) n'asụsụ Bekee depụtara n'akwụkwọ na ọnụ ahịa ejiri la pesent 0.86 gbadata.,"Ọnụọgụgụ a bụ nke ọnwa eprelu bụ ugboro iri na ise ọnụọgụgụ a na-ada kemgbe ebidoro ị gụ ọnụọgụgụ a. E kwụkwara na ọnụ ahịa nke ime obodo bụ nke bekee kpọrọ ""rụral inflation"" siri na pesent 12.99 rida na pesent 12.13 n'ọnwa eprelu kwa. Otu onye na-azụ ahịa na ahịa Oyingbo na Legọs bụ Grace Ogbonna gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ọnụ ahịa a emetụtaghị nrị ndị ha na-ere ere n'ahịa. Oriakụ Ogbonna kwuru na nrị dịka osikapa, agwa, garri na mmanụ nrị tinyechara ego ma enyocha ya kemgbe afọ gara aga. Tomato na-adị arị elu n'oge udu mmiri. Gee ihe Grace Ogbonna gwara BBC Igbo n'uju Ọnụ ahịa adaala n'ezie? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55255879,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55255879,Nsude Pyramid: Igbo nwere 'Pyramid' mgbe gboo,"Mkpuru Uto bụ nke Bekee kpọrọ Pyramid bụ ebe ndị Igbo na-efe ofufe mgbe gboo. Ọ dị na Nsude, nke dị na Enugwu steeti.","Ya bụ Mkpuru Uto dị iri n'ọgụ nke na-egosi obodo iri dị na gburugburu ebe ahụ bụ ndị na-efe chi ha ebe ahụ. Ugbua, naanị ndị na-eme omenala bi na Nsude na-achọ ịmekwata ya. Anya ndị Enugwu steeti Tourism Board dịkwa na-ebe ahụ. Ana atụ anya na ha nwereike iso ndị obodo mee ka ya bụ ebe yie ihe. Lee ihe foro na ya bụ Ugwu Uto. Ndị mere akụkọ a: Chiemela Peters Mgbeahuru na Chris Sanctus Okereke" afirika-52649999,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52649999,Supreme Court Judgement: Ihe mere Ifeanyi Ubah ji merie n'ụloikpe kachasị,Ulọikpe kachasị na Naịjirịa nọọrọ n'Abuja ụnyaahụ kwuo hoohaa na ọ bụ Ifeanyi Ubah meriri na ntuliaka ịnọchiteanya ndị Anambra South n'ụlọomeiwu.,Ndị ọkaikpe mmadụ ise gbakwasịrị ụkwụ n'ikpe ụlọikpe 'Appeal' kpere na mbụ nke kagburu ọchụchụ a chụrụ Ubah. Ụlọikpe 'Appeal' sị ikpe a ụlọikpe ukwu nyere aṅụjughi mmiri afọ ya mere o jiri kagbuo ya. Sịnetọ Ifeanyi Ubah ji ọkọlọtọ Young Democratic Party zọọ ọchịchị ebe ndị na-ama ya aka bụ Chris Uba na Obinna Uzor. Ha kpụpụrụ Ubah n'ụlọikpe kwuo na o ji asambodo 'NECO' adịgboroja zọọ ọkwa sịnetọ n'ọnwa Febụwarị 2019. BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'olu Ifeanyi Ubah mana ọ zaghị ekwentị ya. Onye bụ Ifeanyị Ubah? Sinetọ Ifeanyi na Sịnetọ Bassey Akpan n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-45154126,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45154126,Ihe mberede ụgbọelu emela n' Amerịka,Onye ọrụ ụgbọelu zuru ụgbọelu mmadụ anọghị n'ime ya n'ọdụụgbọelu Seattle Airport fepụ ma daa n'ike n'obodo mmiri gbara gburugburu dị nso.,"Nwoke ahụ zupụrụ ma ụgboelu agha abụọ chụsoro ya. End of Twitter post, 1 O dobeghị anya ma nwoke ahụ ọ ka dị ndụ ugbua Mana ndị uweojii mpaghara ahụ kwuru na ha echeghị na ọ bụ aka ọrụ ndị na-eyi ndụ egwu. Ndị na-ahazi njem ụgbọelụ kwukwara na ha gbalịrị ịrịọ nwoke ahụ ka o feda tupu ụgbọelu ahụ adaa n'ike.Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50985241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50985241,"E menyụọla ọkụ na-agba ahịa Ogbete, Enugwu","E menyụọla ọkụ ọgbụgba dapụtara n' ahịa Ogbete dị n'Enugwu n'ehihie Fraide, ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 2020, tupu o mebie nnukwu ihe.","Ọkụ gbaburu Ahia Obiagụ dịkwa n'Enugwu n'afọ End of Twitter post, 1 Ndị nọ ebe ihe mere kwuru n'ọ bụ ọdọ ndị na-ere 'foam' ebe 'Railway' ka ya bụ ọkụ na-agba. Otu onye n'ime ha kpọrọ onwe ya 'Nnadozie' kwuru na ọkụ ahụ bidoro n' igwe na-enye ọkụ latrik a dọwara n'elu ụlọ dị n'ahịa ahụ ma feesee n'ngwa ahịa ndị mmadụ kwasara n'elu ụlọ. Mana ndị ahịa menyụrụ ya ma kwụsị ya ịbanye n'ime ọdọahịa ndị mmadụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu" 44467936,https://www.bbc.com/igbo/44467936,Ụloikpe jụrụ inye Shekarau akwụkwọ ifepụ gaa Hajj,Ọkaikpe Zainab Bage Abubakar nke ụlọikpe ukwu dị na Kano ajụla inye onye bụbu Gọvanọ Kano steeti bụ Ibrahim Shekarau akwụkwọ njirimara onye na mba ụwa(international passport) maka ịga mba Saudi Arebia maka hajj.,"Ibrahim Shekarau chịburu dịka Gọvanọ Kano steeti Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ gbara Shekarau na mmadụ abụọ ndị ọzọ; Aminu Bashir Wali na Mansur Ahmed, akwụkwọ maka ebubo na ha kere ego nde naịra 950 nke si n' ime ego nde dọla 115 bụ ego Deizani Alison-Madueke onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi mefuru maka ntuliaka 2015. Shekarau rịrọrọ ụlọikpe n'akwụkwọ o degara ha n'abalị 28 ọnwa Mee ka e nye ya akwụkwọ iji nyere ya aka mee njem bido n'abali 30 ọnwa Mee rue Juun 23 maka hajj. Mana oge ikpe ahụ ruru, Ọkaikpe Zainab Abubakar jụrụ imere ya ihe ọ rịọrọ. Abụbakar kwuru: 'Ka m tulechara akwụkwọ ahụ nke o tinyere iji rịọ arịrịo ahụ, ma hụkwa ọsịsa nke e nyere n'okwu ahụ, ahụrụ m na ọdịghị mkpa inye onye rịọrọ arịrịọ a ihe ọ rịọrọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54833740,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54833740,"Daddy Hezekiah: E meghi m ihe m meere Donald Trump maka ""Visa""",Daddy Hezekiah na ndị ụlọụka ya malitere iwu n'izuụka emere ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka.,"Ihe mere ha ji ewu bụ n'ihi ihe onyonyo gosiri ebe ndị ụlọụka ya na-agagharị nke Trump n'onwe ya gosiri n'akara Twitter ya. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Daddy Hezekiah kọwara ihe mere o ji hụ nwoke ahụ na anya. Gee ihe o kwuru n'uju:" afirika-43944963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43944963,'Igbo amaghị ihe',Joe Igbokwe bụ ọnu na-ekwuchitere ndị APC na Legọs steetị ma bụkwara onye ihe gbasara ndị Igbo na-emetụ n'obi.,"Na mkparitaụka ya na ndị BBC Igbo nwere, ọ gwara anyị ihe o chere maka Ndịgbo na ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ntụliaka nke 2019 na-abịa. O sikwara na ọ bụrụ na ndị Igbo ma ndọrọndọrọ ọchịchị eme, APGA agaghị anọ na naanị otu steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44806891,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44806891,Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ịmata maka atụmatụ a,"N'ụbọchị Wenezde, oge ọ na- anabata onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa bịara njem nleta, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa na ya ga-ebinye anya n'akwụkwọ nkwekọrịta ka obodo 44 dị n'Afrịka na-azụ ma na ere ahịa na enweghi mgbochi ọbụla nke a kpọrọ 'African Continental Free Trade Agreement(AfCFTA)' na bekee.","Bongo Adi :Ihe 'Africa Free Trade Agreement' pụtara Cheta n'abali 21 ọnwa Maach afọ a, onyeisiala Buahari kagburu ọgbakọ mba dị na Afrịka nke a na-akpọ, 'African Union'( AU) ebe ọ kara ibinye aka na nkwekọrịta a ga-eji bido""African Continental Free Trade Area."" Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria dịka onye bụbu onyeisiala, Olusegun Obasanjo, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye(civil society groups) dịka otu SERAP katọrọ Gọọmenti Buhari maka iweghachi aka elekere azụ site na ịjụ itinye aka n'akwụkwọ ahụ. Ndị isiala mba Afrika nwere ọgbakọ maka nkwekọrịta azụmahịa n' ọnwa maach Mana, ụfọdụ otu, dịka otu jikọrọ ndị ọrụ nke a kpọrọ, 'Nigeria Labour Congress' (NLC) toro ya ma kwuo na ị ga n'ihu na nkwekọrịta a ga-ebute ịchụ n'ọrụ maọbụ mbawanye enweghị ọrụ. Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC na ọkamụta n'ihe gbasara akụnaụba nke a kpọrọ economist na bekee na mahadum, 'Lagos Business School' bụ Bongo Adi nwere, o kwuru na ọ bụ ihe dị mma na onyeisiala kpebiri itinye aka na nkwekọrịta ahụ. Mana dịka okwu a na-aga, lee ọsịsa ajụjụ ise dị mkpa na nkwekọrịta azụahịa n'Afrịka dịka Bongo Adi siri kọwa ya: 1. Gịnị bụ ""African Continental Free Trade Agreement""? Nke a bụ nkwekọrịta nke obodo dị n'Afrịka izụrịta ahịa na enweghị mgbochi ọbụla . Bongo Adi kwuru na 'Free Trade Agreement' ""bụ azụmahịa na-agara onwe ya na e nweghị mgbochi ọbụla."" Ọmụmatụ; North American Free Trade Agreement, European Union, ASEAN(Trade agreement by Association of Southeast Asian Countries) wdg. 2. Kedụ mba ndị binyereka akwụkwọ na nkwekọrịta AfCFTA? Mba 44 n'ime Mba 55 nọ n'Afrịka binyerela aka na nkwekọrịta ahụ. Obodo ndị etinyebeghị aha n'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ gụnyere Nigeria, Benin, Botswana, Eritrea, Guinea-Bissau na Zambia. 3. Kedụ uru dị na AfCFTA? 1. Ọ ga-akwalite ọnọdụ obibi ndụ ndị Naijirịa- Ihe anyị nwekarịrị bụ akụ si n' ala Dịka Ọkammụta Bongo Adi siri kọwa, ọ bụghị mba niile nwere ike imepụta ihe ndị dị ha mkpa. ""Anyị adịghị emepụta ụgbọala, na ngwa ahịa e ji arụ ọrụ (capital goods), ihe anyị nwere bụ akụ dị n'ime ala, ọ bụru na-enweghị azụmahịa, ihe ndị a agaghị abata."" 2. Ọ ga-akwalite ụlọ mmepụta ngwaahịa ka ha nwe ike na-arụpụta ihe ha ga na-ezipụ mba ndị ọzọ 3. Adi kwukwara na ọ ga-eme ka a na-emepụta ngwahịa n'ọnụ ala 4. O kwukwara na ọ ga-eme ka Naijiria na-amụta nka imepụta ihe site n'aka mba Afrịka ndị ọzọ 4. O nwere ọghọm dị na atụmatụ a? Ọ bụrụ na e mepe ụzọ, ngwaahịa ndị mba ọzọ ga-ejuputa n'ala Naijiria mee ka ụlọ mmepụta ngwahịa Naijirii sọwa ganịganị. 5. Kedụ ụzọ e nwere ike isi gbalahụ ọghọm dị na nkwekọrịta a? O kwesighi ka emepe ụzọ fororo ka ihe ọbụla na-abata ala anyị. Bongo Adi dụrụ ọdụ sị, ""A ga na-ahọ ihe ndị a ga na-ekwe ka ọ bata. ihe ndị a na-eri eri dịka nfa-eze ( toothpick) na ihe ndị ọzọ abụghị ihe e kwesiri ka ọ na-abata."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-51798518,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51798518,Chineme Martins: Ihe i kwesịrị ịma maka Chineme onye nwụrụ mgbe ọ na-agba bọọlụ,Ndị ọrụ Nigeria Football Federation (NFF) na ndị League Management Company (LMC) na-eru uju maka ọnwụ onye otu egwubọọlọ ndị Nasarawa United bụ Chineme Martins bụ onye gbabiiri nwụọ ka ha na ndị otu Kastina United na asọkarịta mpị na Sunde.,"Chineme Martins banyere Nasarawa United na 2015 Onyeisi ọrụ ndị LMC kasiri ndị be ha obi ma kwukwa na ha na-ama imi n'ala ịmata ihe butere ọnwụ ya bụ nwaamadị. N'aka ọzọ, NFF sị na ọnwụ ya bụ nwaamadị wutere ha ebe ọ dị ukwuu. Akụkọ kọrọ na Martins dara n'ala na nkeji iri anọ na atọ (43) na ya bụ asọmpi. Ndị ọrụ ahụike ndị otu egwubọọlụ abụọ ahụ gbara mbọ ịzọ ya ndụ tupu ha ebụga ya ụlọọgwụ bụ ebe ha kwuru na ọ hapụla. Ndị otu egwubọolụ ya bụ Nasarawa United mechere jiri ọkpụ goolu atọ (3) merie ya bụ egwuregwu bụ nke Chinedum Ohanachom nyechara. Onye bụ Chineme Martins? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43436959,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43436959,Amnesty Int'l ekpeela Shell na Eni ọzọ,Otu akpọrọ Amnesty International agwuala gọọmentị Naịjịrịa ka ha laghachị azụ na-nyocha ihe mere mmanụ agbidi wụufuru na mmirị Naija Delta.,"Ndị Niger Delta na-ebe akwa na mmanụ agbidi emebichala ala ha Ha kwuru na Shell na Eni wụfuru mmanụ ugboro iri na asatọ n'ime Niger Delta. Ha kwukwara na Shell na Eni na-asị asị gbasara ugboro ole ha wụfuru mmanụ na mmiri Niger Delta. Aziza Shell na Eni Shell na Eni ekwuola na ebubo a abụghị eziokwu. Ha kwuru na oge niile mmanụ ugboro wụfuru, ha na-agba mbọ hicha ya. Mana Amnesty International na-ekwu na ha anaghị ehicha mmanụ a n'oge. Ha mara atụ na otu oge Shell na Eni ji ụbọchị narị anọ na iri atọ were hicha mmanụ wụfuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị: ." afirika-44325248,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44325248,Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ncheta Biafra,Ọ fọrọ obere ihe ka obodo niile dị na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa tọgbọ chakoo ebe ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ iji cheta ụbọchị agha Biafra.,"Dịka ọtụtụ ahịa dị n'ala Igbo tọgbọ chakoo, ndị dị na Legọs dịka Aspanda ebe ọtụtụ nNdigbo na-azụ ahịa zụrụ ụbọchị Ncheta Biafra Anambra dara jim ebe ụfọdụ ụlọakụ emeyeghị mana Owerre n'Ụmụahịa biri ndụ ha ka o nweghị ihe mere. Ọtụtụ ndị mmadụ gara n'igwe mbasa ozi dị ịcheịche ị kwu uche ha Leee ya ebe a: Ọ dị ụfọdụ mmadụu ụtọ n'obi ị cheta ụbọchị a Mana ọ bụghị mmadụ niile kwenyere na ya bụ ihe: Ụfọdụ ji ohere ahụ ekele Ojukwu bụ nwoke kpọrọ Biafra aha @steveray2000 kwuru ihe ncheta agha Biafra ji dị mkpa n'elu Twitter" afirika-43225682,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43225682,Massob: Ezigbo nna na onye ndu ahapụla anyị,"Otu a kpọrọ Movement For The Actualization Of The Sovereign State of Biafra bụ Massob nọ n'okpuru ọchịchị nwa amadi, Uchenna Madụ, e soro la ndị be Joe Achuzia, ndị Igbo, na ndị otu Biafra niile n'iru uju onye ndu ma dike ndị Igbo bụ Joe Achuzia, nwụrụ ụbọchị Monday gara aga.","Achuzia, otu na ndị ndu agha Biafra nwụrụ ka ọ gbara afọ ịiri itoolu Ha kwuru na Achuzia wepụtara onwe ya izọpụta ndị nke ya. Na akwụkwọ mgbasa ozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Edeson Samuel tinyere aka, ha gara n'ihu kọwapụta na ike agwụghị Achuzia maka ọgụ mwereonwe Ndigbo na otu Biafra niile n'aka odibo nke ndị Britain. Massob kọwara ya dika onye ndu kachasi nụ na ndị agha Biafra. Ike agwụghị ya ruo mgbe agha ji bie. Akụkọ ndị ga-amasị gị: N'ọnụ okwu ha,""Ezigbo nna,onye nkwado,na onye ndu ahapụla anyị"" Ndị Igbo nakwa ndị Biafra agaghị echefu ya maka dike ọ bụ."" Massob kwekwara nkwa na ha ga-edowe njirimara ya niile. ""Maka Joe Achuzia, anyị ga-atụkwasịkwu ọrụ na mbọ anyị na-agba iji hụ na Biafra biara na mmezu."" Ndị otu Massob na-eru uju maka na ezigbo onye ndu ha ahapụla ha" afirika-48181294,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48181294,Night runners: 'Ịta amusu dị n'agbụrụ ezinaụlọ anyị',Ndị mba Kenya akọọla akụkọ ifo banyere ndị na-ata amusu n'ọtụtụ ọgbọ mana ha amaghị ma akụkọ a ọ dị ire.,A sị na ndị na-ata amusu bụ ndị mmụọ ọjọọ bara n'ime ha mana amaghị ndị ha bụ. Onye ntaakụkọ BBC Africa Eye bụ Tom Odula mere nyocha ma chọpụta na ịta amusu dị ire ma chọpụtakwa otu ezinaụlọ na-ata amusu. Ihe onyonyo a nke o mere setere ndị na-ata amusu dịka ha nọ n'ihu ọrụ ịta amusu. Biko marakwa na enwere foto ndị na-adịchaghị mma ile anya. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-45308902,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45308902,Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Ntuliaka Imo steeti N'imo steeti, ọ dịghị ka e mere ntuliaka nke okpuruọchịchị taa ka ndị mmadụ na-agagharị na-eme ihe masịrị ha. Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti Ụfọdụ ụmụnwaanyị nọ na-agba egwu na-ekwu na ha agaghị eme ntuliaka maka na enwebeghị ihe na-aga ọfụma na steeti ahụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti: Ọ dịghị ka a na-eme ntuliaka Delta steeti Onye bụbu gọvanọ Delta steeti bụ Emmanuel Uduaghan esonyela na ndị gbaghapụrụ otu pati PDP gafee APC. Ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nwere ike ibute ọnwụ PDP na steeti ahụ, ndị APC na-ekwu na Uduaghan ga-abara ha uru. Na mba ofesi, A ga-eli ozu Kofi Annan bụbu odeakwụkwọ nke ngalaba United Nations n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Septemba, n'ebe a na-eli ndị agha n'obodo Burma dị na mba Gana. Onyeisiala Gana bụ Nana Akuffo-Addo gwara ezinaụlọ ya ka ha ghara inye onwe ha nsogbu gbasara akwamozu ya, maka na a ga-akwa ya ka onyeisiala. N'egwuregwu, Osu ọkpọ Naịjirịa bụ Efe Ajagba mepụrụ Curtis Harper bụ onye mba Amerịka ụjọ ụnyaahụ. Efe Ajagba nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi Olimpiks e mere na mba Brazil na 2016 Ajagba meriri na-esughị otu mkpụrụ ọkpọ makana Harper ji ọsọ gbapụ n'ogige ebe ahụ, amabeghị ihe kpatara nke a. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Onyeisi ahịa akpụkpọụkwụ dị n'Arịarịa agwala BBC Igbo na ha zuru ka e mee ịrụ akpụkpọụkwụ niile ụmụ Naịjirịa ga-eyinwu. 'Arịarịa ga-arụkarị China ma ha nwee ohere'" afirika-43123748,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43123748,2019: 'Ndị otimkpu Madumere na nke Nwosu etiela ọkpọ',Akụko n'eru anyi ntị na-akọwa na ndị mmadụ merụrụ ahụ ụnyaahụ mgbe ndị a na-eche na ha bu ndị otimkpu osote Gọvanọ Imo Steeti bụ Eze Madumere na nke ọgọ nwoke Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Uche Nwosu malitere ịlụ ọgọ na nzụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị emere na Mbaitoli.,"Rochas Okorocha wepụtara ụlọọrụ na ahụ maka aṅụri nke nwanne ya nwaanyị bụ onye ndu. Nke a mere n'ụlọ nzụkọ obodo Mbaitoli ebe ndị nso Nwosu gara ị nye ya nkwado maka ị zọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2019. Otu onye mbaitoli nọ na nzụkọ ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu nke Nwosu a na-akpọ 'I Believe' n'olu bekee zigara ha ozi nzụkọ, na-agwaghị ha ịhe ga-eme na ya bụ nzụkọ a. Ọ sị kwara na iwe were ha mgbe ha ruru ebe ahụ, ndị ọbịa ekwuo na ọ bụ nkwadọ Nwosu ka ha bịara ime. Ndị nọ na obodo ahụ hụrụ nke a ka mkparị maka Madumere si ebe ahụ. Rochas kwuru n'izu ụka gara aga na ọ ga kwado ọgọ ya nwoke bụ Nwosu ma ọ pụta ịzọ ọchịchị afọ 2019. Imo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr? Onye nọ ebe ịhe mere kwuru na ndị Mbaitoli jụrụ isonye na nkwado Nwosu, ka ndị ọzọ ebido tiwe mkpu ""anyị kwadoro Uche Nwosu"", ya mere ọgụ wee bido. Ọ sị na ndị otu Nwosu ji ihe dị ịcheịche we wakpo ha n'ebe ahụ, kwuo na ndị otu Nwosu akwanyeghị ha ugwu na ihe a ha mere. BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ ndị ihe metụtara mana ha azabeghị anyị mbe akụkọ a pụrụ. Mana, onye na ekwu maka ọganiru Imo Steetị na ihe ozi ọhụru a na-akpọ 'social media' n'asụsụ Bekee bụ Jones FCC Onwuasoanya gwara BBC Igbo na onweghị ọgu a nụrụ na nzukọ a. Mana, ọ gara n'iru si na onwere ndị ha eche na ha bu ndị kwenyere na Madumere bịara ebe nzukọ a bia ịyasa ya. Ọ sirir na Uche Nwosu amaghi maka nzukọ a maka o were ọtụtụ otu na akwado ka ọbụrụ Gọvanọ. Onwuasoanya zitere anyị foto o sị si na nzukọ a. Ndị bịara nzukọ na Mbaitoli" afirika-50515746,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50515746,Etu Nnewi siri malite - Igwe Orizu,Igwe Orizu nke Nnewi bu eze ọdịnala kachasị nọdụ n'oche n'ala Igbo.,"N'ihe inkiri a ọ kọwara etu ọchịchị ya siri dabanye n'ụwa ọhụrụ. Ọ gakwara n'ihu kọwa etu Nnewi siri pụta ma kwụrụ ugbua. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiemela Peter Mgbeahuru na Nnamdi Agbanelo" afirika-49792848,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49792848,"Minimum Wage: 'Anyi eriwela N30,000 ụgwọ opekata mpe' - Ndị ọrụ Gọọmentị.","Dịka Minista na-ahu maka ọrụ na nrụpụta bụ Chris Ngige na-ekwu na-ebidola ịkwụ ụgwọ opekata mpe Gọọmentị hibere, ụfọdụ ndị ọrụ Gọomentị na-ekwu na ọbụghi eziokwu ebe ụfọdu na aṅụrị na ha eriwele elele a.","Tony Ozurumba bụ onyeisioche ndị 'Joint Health Sector' nke ụlọọgwụ na-ahụ maka ndị ọrịa isimgbaka ( Federal Neurophsychiatric) dị n'Enugwu steeti kwuru na ha anatabeghị ụgwọ opeketempe a. N'aka nke ọzọ, otu onye ọrụ gọọmenti na-arụ n'Abuja na achọghị ka akpo aha ya kwuru na ha natara ya bụ ụgwọọnwa opekata mpe n'ọnwa Ọgụstu. Cheta na-ebulịrị ụgwọ ọnwa a site na puku naira iri na asatọ n'afọ 2018 were bulite ya ruo puku naira iri atọ n'afọ 2019. BBC kpọrọ Minista Chris Ngige na-ahụ maka ndị ọrụ Naịjirịa ka ọ kọwara anyị ihe mere na ụfọdụ ndị nwetere ụgwọ a ebe ụfọdụ enweteghị. Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke Minista a bụ Nwachukwu Obidiwe, kwuru na ya na Minista Chris Ngige akpabeghị maka ndapụta a. Obidiwe si na Minista Ngige gara ala Igbo kemgbe Tụzde ma si na ha abụọ enwebeghị mkparịta ụka kemgbe ọ lọtara. Kama ọ kwuru na Minista ga-aza ajụjụ a na mgbede. Anyị ka ga-ewetere ụnụ akụkọ a n'uju. Akụko ga-amasị gị Ihe nkịrị ga-amasị gị Idu Okwuosa" afirika-46196729,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46196729,Fake News: Ugboro ise akụkọ ụgha kpọtụrụ n'Ala Igbo,Gịnị bụ akukọ ụgha (fake news)?,"Ndị na-agbasa akụkọ Jubril sị na ọ bụ ntị ya ka ha na-ele, mana nti Buharị nke aka nri na nke aka ekpe ya adịghị otu Ajụjụ a bụ ihe ọbụrụ na a jụrụ ya mmadụ ihe dịka afọ isii gara aga, o mee ngwa ngwa kwuo na ọ bụ akụkọ ụgha, ma maa atụ ụdịrị akụko a. Mana ugbua, n'agbanyeghị na ihe bụ akukọ ụgha agbanwebeghị, atụ ya abụghịzị etu ọ dị na mbụ. Ugbua, ọtụtụ mmadụ amaghịzị nke bụ eziokwu, maọbụ nke bụ asị. BBC gbara mbọ dee etu a ga-eji mata nke bụ akụko ụgha. Gụọ maka ya ebe a: ""Etu akụkọ ụgha si akwanye ọku n'ọgbaghara ọchịehi"". N'azụ nke ahu, lee ugboro ise akụkọ ụgha wuru ọfụma n'ala Igbo: 1) Jubril nke Sudan Ihe na-ewu n'Igbo ugbua bụ na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari abụrụla onye lara mmụọ. Akụkọ a, nke malitere n'ọnụ Nnamdị Kanu, bụ onyeisi ndị a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), kwuru na Buhari nwụrụ n'afọ 2017. O kwukwara na a gara mba Sudan kpọta otu nwoke a kpọrọ Jubril, kpọrọ ya gaa mba ofesi, megharịa ihu ya na agwa ya. N'ọnụ Kanu na ndị na-akwado ya, ""Onye nọ n'Aso Rock abụghị Buhari."" Femi Fani-Kayode, bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, sokwa agbasa akụkọ a: 2) ""Monkey Pox"" N'afọ 2017, ndịagha Naịjirịa gara obodo Ozubulu ime ihe ha kpọrọ ""medical outreach"" na Bekee. Ka ha nọ ebe ha na-eme emume ahụ, mkpu bidoro dawa n'Ọnịcha, Enugwu, Owere, Pọtakọt, na ọtụtụ obodo ndị ọzọ. Mkpu a butere ajọ ọsọ makana akụkọ ụgha kwuru na ndịagha na-aga ụlọakwụkwọ agba ụmụaka ọgwụ n'ike. Akụkọ ụgha a sitere n'akara Facebook ndị Radio Biafra. 3) Ndịagha Naịjirịa ji Nnamdi Kanu n'ime ụgbọmmiri Femi Fani-Kayode, bụ onye aha ya pụtara n'elu maka akukọ ụgha a, sokwa sunye ọkụ n'akụkọ kwuru na Nnamdi Kanu nọ n'aka ndịagha Naịjirịa n'ime ụgbọmmiri dị n'osimili. Akụkọ a wuru ewu, mana asị ọ bụ gbara n'anwụ mgbe Kanu pụtara ma kọọ etu o si gbapụ na be ya. 4) Davido na Chioma N'ọnwa Ọktoba nke afọ a, The Cable, bụ ụlọ ntaakụkọ na-agbasa ozi n'ịntanet, dere na otiegwu a ma ama aha ya bụ Davido na nwaada ya na ya na ayị a kpọrọ Chioma, agbasaala. Ka nke a ka na-akpọtụ, Davido gara na Twitter dee na nke a bụ asị. 5) Naịjirịa ga-aba Israel ọgụ maka Kanu Ka akụkọ na Nnamdi Kanu apụtala ihe n'Izrel ruru Naịjirịa, akukọ pụtara na Lai Mohammed, bụ minista na-ahụ maka mgbasaozi, kwere nkwa na Naịjirịa ga-ebuso Izrel agha maka ya. Lai Mohammed mechara jiri akụkọ a mee akaja makana ọ sị na onweghi mgbe o kwuru ụdịrị okwu a. Ọtụmatụ ụdịrị akụkọ a karịrị, makana akụkọ ụgha ewerela oche n'obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53126268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53126268,Coronavirus in Africa: 'Ebumnobi m bụ ịhụ na ụmụnwaanyị di ime agaghị na-enwe nchekasị',Dkt Jemimah Muthoni bụ dọkịta ọmụmụ nwa na mba Kenya ekwuola etu o si enyere ụmụnwaanyị dị ime aka ọkachasị n'oge coronavirus a.,"Muthoni na-arụ n'ụlọọgwụ Kenyatta National n'isi obodo Nairobi, kọwara etu o si malite atụmatụ ọ kpọrọ ""Wheels For Life"". Ọ kọwara etu ozi o zipuru na Twitter nke wuru ewu si bido atụmatụ a. Atụmatụ ahụ na-enye ụmụnwaanyị ime na-eme maọbụ ndị nwere gbatagbata ọbụla n'abalị gbasara afọ ime ha maọbụ nwa ha, ohere ịnweta ụgbọala njem. O kwuru na ebumnobi ya bụ ịhụ na ụmụnwaanyị di ime agaghị na-enwe nchekasị." afirika-43765267,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43765267,Taa bụ afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Taa bụ ncheta afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok N'ụbọchi taa, Naịjirịa na otu dị iche iche na mba ụwa niile dịka UNICEF, BBOG na-echeta afọ anọ atọrọ ụmụ akwụkwọ Chibok dị narị abụọ na iri asaa na isii. Cheta n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 ka ndị Boko Haram tọọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Chibok nke Borno Steeti. Atọọrọ ụmụakwụkwọ Chịbok n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 Ndị Afara Ukwu Ibeku, Abia Steeti Ahụbeghị onye Eze ha Praịm mịnịsta ọdịnala nke Ụmụobasi,Isiama Afara Ukwu bụ Chiemelam Odoemelam etiela na mkpu na ndị obodo ha ahụbeghị onye Eze ha bụ Isreal Okwu Kanu nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu. Ọ rịọrọ ka ndị ji ya na ezinaụlọ ya kpọpụta onye Eze ha ma ọ dị ndụ ma ọ ọnwụrụ anwụ Ndị agha Naịjirịa wakporo ezinaụlọ Obieze Eze Isreal Okwu Kanu bu nna Ipob bụ Nnamdi Kanu Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mba Amerịka, Uk na Fransị atụọla ogbunigwe na mba Sirịa Mba Amerịka , United Kingdom na Fransị agbakọtala aka ọnụ tụọ ogbunigwe n'ụlọọrụ ebe a na-eme ngwaagha kemịkal na mba Sirịa, maka mwakpo ha jiri ngwaagha ahụ mee n'obodo Douma. Ogbunigwe a gbara n'isi obodo Sirịa bụ Damascus, nakwa obodo abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs. Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ N'egwuregwu N'abalị ụnyaahụ, ụmụ afọ Naịjirịa zakọọrọ nrite ọlaedo anọ nke mere ya ọlaedo asatọ ha nwetarala n'egwuregwu commonwealth. Naịjirịa bụ ndị abụọ kachasị enweta ihe nrite na Afrịka ma agụpụ mba Saụt Afrịka. Ụmụ Naịjirịa na-anọchite Naịjirịa n'egwuregwu ahụ Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana. Ụmụnwaanyị Ghana tụrụ ime n'aka ndị China na ụmụ ha n'ata ahụhụ" 43882575,https://www.bbc.com/igbo/43882575,World Cancer Day: Etu m si nweta ọgwụgwọ ọrịa kansa - Onye meriri Kansa ara,Ọrịa kansa bụ ọrịa na-eyi ụwa niile egwu maka etu o si egbu ndị mmadụ. Nke ka njọ bụ ndị na-achọ ọgwụgwọ na-achọ ya mana onwebeghi ọgwụ ewepụtara na ya bụ ọgwụgwọ ya.,"Isiokwu emume ncheta ọrịa Kansa nke afọ 2019 bụ ""Enwere m ike , ị nwere ike"" nke pụtara na anyị niile nwereike ịwakpo ọrịa Kansa. Mana nwaada Gloria bụ onye chọpụtara akpụ kansa n'ara ya n'afọ 2010, a waa ya ahụ, o mee kimo na ihe ndị ọzọ niile wee merie ya bụ ọrịa. N'okwu ya , ""Kansa abụghị ikpe ọnwụ"", ugbua, ọ na-etinye ọnụ na okwu gbasara ụmụnwaanyị kansa na-arịa. Ọ gwara BBC Igbo etu o siri merịe ya bụ ọrịa na-atụ ụwa niile egwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44079944,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079944,Abia na Enugwu steeti akọwala ka ha si dị njikere maka ide mmiri,"Enugwu na Abia bụ steetị ndi dị na mpaghara ọdịda Naịjirịa ekwụrụ na ide mmiri nwere ike imetụta, ekwuola ụzọ dị icheiche ha ji diri dị njikere igbochiri ọdachi.","Oke mmiri ozuzo na-ebutekwa mbuze Cheta na Ngalaba na-ahụ ihe gbasara ihuigwe akpọrọ Nigeria Hydrological Agency na Bekee dọrọ aka na ntị ụnyaahụ na ide mmiri si n'oke mmiri ozuzo ga-emetụta steeti iri atọ n'ise na Naịjiria. Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu n'Enugwu steeti bụ Fidel Ayogu gwara BBC Igbo na-ekwe ntị etu steeti ahụ si akwado. Ọdọ mmiri tiwara na mba Kenya maka oke mmiri ozuzo mefuru ndụ mmadụ ruru 40 Ọ sị: ""anyị agwaala ndị mmadụ ha kpochapụ ahịhia ebe mmiri si aga maka ị gbochi ide ga-eto ma oke mmiri zoo."" N'Abịa ha na-eme ihe yi kwara nke a ebe Kọmishona ji ọrụ mgbasa ozi ebe ahụ bụ John Okeiyi kwuru na ha na-ekpocha ụzọ niile mmiri ga esi ga n'Aba karịcha. Gee ihe ha abụọ gwara BBC n'uju ebe a: Ihe John Okiyi kwuru gbasara okwu a Ihe Fidel Ayogu kwuru gbasara oke mmiri ozizo Ha niile na ele anya na ihe a ha mere ga-eme ka ide mmiri gharị imebi ihe nke ukwu." afirika-52081647,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52081647,Coronavirus: 'Agụụ ga-egbu anyị na ụmụaka ma gọmenti mechie ahịa n'Enugwu',"Dịka gọọmenti Enugwu na-amalite mmachị ahịa, ụka, njem nakwa ngagharị ọbụla, ụmụ nwaanyị na-azụ ahịa na Akwata arịọla gọọmentị Enugwu steeti ka ọ ghara imechi ahịa kpam kpam.","Ha kwuru na nke a bụ n'ihi na ha enweghị ego ha ga-eji zụọ ụmụ ha nri. Mgbe BBC rutere na ya bụ ahịa, ndị ahịa ahụ kọwara na ka ha si eri nri bụ site na igota tomato, ose nakwa yabasị kwa ụbọchị, ree ya were nweta ọmụrụ nwa. Ha rịọrọ gọọmenti ka o nye ha ego iti aka n'obi tupu emechie ahịa ahụ n'izu ụka a, ka agụụ ghara igbu ha na ezinaụlọ ha. Gọọmenti Enugwu steeti mara iwu ka ahịa, ụlọ ọrụ, ụlọ ụka nakwa njem gbaa bụreki malite echi site na ndị mmadụ ịnọrọ n'ụlọ ha ka ewere buso nje Coronavirus agha. Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara." afirika-48765903,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48765903,AFCON Group F Result: Cameroun achụpụla Guinea-Bissau ajọ mmụọ n'anya,Otu 'Indomitable Lions' nke Kamerun ewerela ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Gini Bissaụ na mmalite njem ha na asọmpi AFCON 2019.,"Cameroun achụpụla Guinea-Bissau Goolu nke mbụ si n'aka Yaya Banana wee bia na nkeji 66, ebe Stephane Bahoken nyere nke abụọ na nkeji 69. Mmeri a enyela Kamerun akara atọ iji bụrụ ndị nke mbụ na 'Group F'. Kamerun na Gana ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Satọdee abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun. N'egwuregwu nke ọzọ e nwere taa, otu egwu mba Gana na ndị Bene Repọblik zutere onwe ha ma were goolu abụọ gbaa onwe ha onye lawa, onye lawa." afirika-56842212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56842212,"Anambra state airport photos: Lekwa ka ọdọụgbọelu ọhụrụ a na-arụ n'Anambara steeti dị n'ụbọchị Eprelu 21, 2021",Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ụgbọelu mbụ ga-efebata n'ọdọụgbọelu ha na-arụ ọhụrụ n'Ụmụeri na ngwụcha ọnwa Epreelụ nke 2021.,"Elu 'control tower' n'ọdọụgbọelu Anambra Dịka ha jri kwuo, ọdọụgbọelu a ga-abụ nke na-ahụ maka ntụbata nakwa mbupu ngwaahịa dị iche iche. BBC Igbo gara njem nleta ya bụ ọdọụgbọelu. Lekwa foto ndị si ebe ahụ pụta: Ụlọọrụ ọdọugboelu Anambra Ka 'control tower' ọdọ ụgbọelu Anambra sị dị Ụlọ ebe a na-eche ụgbọelu n'ọdọụgbọelu Anambra Ụlọ ebe a na-eche ụgbọelu n'ọdọụgbọelu Anambra Okporoụzọ mfepụ ụgbọelu ọdọụgbọelu Anambra Okporoụzọ mfepụ ụgbọelu ọdọụgbọelu Anambra Okporoụzọ mfepụ ụgbọelu ọdọụgbọelu Anambra Ọdọụgbọala n'ọdọụgbọelu Anambra Ihu ụlọọrụ ọdọụgbọelu Anambra Okporoụzọ mfepụ ụgbọelu ọdọụgbọelu Anambra" afirika-55161503,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55161503,World Disability Day: 'Achọọla m ọrụ ọtụtụ ebe mana anaghị enye m n'ihi na abụ m ngwọrọ',Emmanuel Eboseremhen bụ onye ngworo na-agba mbọ karịa ọtụtụ ndị ahụ zuru oke.,"O ritere nturugo na Mahadum n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. N'agbanyeghị na ọnọdụ ya ekweghị ya nweta ọrụ, Emmanuel kwuru na ya ga-enwerịrị ụlọọrụ onyonyo nke ya. Ọ kọkwara etu ịgụ egwu si enyere ya aka agabiga ọtụtụ ihe na ndụ ya. Gere mkparịtaụka ya na BBC n'uju. Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a." afirika-48733304,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48733304,CAF 2019: Naịjirịa ejirila Burundi taa atụ ụtụtụ,Otu Super Eagles nke Naịjiria azarala aha nna ha dịka ha ji mmeri mepe asọmpi iko mba Afrịka nke 2019.,Ọ bụ na nkeji 77 ka Ighalo jiri otu ọkpụ dọka neeti ndị Burundi. Mba Burundi nwara ike ha ị sata goolu ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ na ngwụcha asọmpi ahụ. N'ime ihe a niile otu onye aha ya na-ewu ewu bụ Samuel Chukwueze dịka ọ gosiri onwe ya n'asọmpị a. Cheta na Samuel Kalu esoghi ibe ya gbaa bọọlụ taa dịka o koropuru ụnya ahụ mgbe ha na-eme nkuzi. Lekwa ozi Kanu Nwankwo ziri ndị Super Eagles tupu ha ezute mba Burundi. egwuregwu-44514666,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44514666,Akụkọ kachasị na mgbede a: Ebenebe gburu na Borno steeti,Akụkọ ndị dị mkpa:,"Ụmụ nwaanyị isii, ụfọdụ n'ime ha ndị oji ogbunigwe egbu onwe, egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na otu n'obodo Damboa dị na Borno steeti. Akụkọ kwuru na nke a mere Na-erughị elekere abụọ onye isiagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai, gwachara ndị gbara ọsọndụ na mpaghara ahụ ka ha laghachị maka na udo adịla. N'akụkọ yiri nke a, Mmadụ iri abụọ anwụọla ebe ụmụ nwoke abụọ bu egbe wakporo ndị mmadụ na mmemme ime abali n'obodo Trenton na New Jersey nke dị na mba Amerịka. Ndị uweoji ekwuola na a gbagburu otu n'ime ụmụnwoke ahụ ma nwụchịkwaa nke ọzọ. Ọzọ na Naịjirịa, Ngalaba na-ahụ maka mgbasa ọkụ latrik bụ Transmission company of Nigeria ekwuola na ọkụ latrik ejirila ihe ruru otu puku megawatt n'ọma datuo. Ha kwuru na ọ bụ okporo mmanụ gas kụwara akụwa na nsogbu ndị ọzọ butere nke a. N'egwuregwu, Serbia emeriela Kọsta Rịka ebe Mekziko ji otu ọkpụ merie Jamini ka ha gbachara. Brazil amalitela egwuregwu ha ma burukwa ụzọ nye goolu ebe ha zutere Swizaland. Gee nkeji nke mgbede a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe onyonyo nke taa Gwa anyị ihe puru iche iji echeta nna gị?" mba-uba-43460322,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43460322,Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ na Amerịka,Uber bụ ndị so na emepụta ugbọala na anya onwe ya ekwuola na ha akwụsila ntule ụgbọ na-anya onwe ya ka otu ụgbọala ha kụgbụrụ otu nwaanyị dị afọ 49 na-agbafe okporoụzọ n'obodo Tempe dị na Arizona.,"Ụlọọrụ Uber egosila obi mwute maka nwaanyị ụgboala ha gburu Dịka akụkọ si were kwuo, ihe ọdachị a mere ka ụlọọrụ Uber kwụsị ntule ụgbọ na-anya onwe ya ahụ ha bidoro. Onyeisi Uber bụ Dara Khosrowshahi kwuru na Twitter na ọnwụ ahụ bụ ihe 'oke obi mgbawa"". ""Anyị na-eche maka ezinaụlọ ọ dachi metụtara ma anyị na ndị ụweọjịị na-arụkọrịta iji ghọta ka ihe siri mee."" End of Twitter post, 1 Ihe mberede a abụghị sọ sọ Uber ka o metụtara, ọ ga emetụta mbọ a na-agba iji rụpụta ụgbọala na-agba onwe ya maka njem ọra mmadụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45117736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45117736,Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Akpabio agbaghapụla PDP bụrụ onye APC n'eziokwu,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ na Sinetọ Godswill Akpabio bụbu gọvanọ Akwa Ibom steeti emeela ihe dị ya n'obi. Taa ka Akpabio kwuputara na ọ gbajọọla PDP gafee APC. Ebe ọzọ na Naịjirịa Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ekwuola na obi anaghị amapụ ndị omeiwu maka mgbochi e gbochiri ha ụnyaahụ. O kwuru nke a ebe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ọ kpọkuru taa n'Abuja. Gụọ akụkọ n'uju ebe a: Mkparị ọbụla e nyere ụlọomeiwu bụ ụmụ Naịjirịa ka e nyere ya - Saraki Mba Ofesi: Ihe ọma emeerela Simone Gbagbo bụ nwunye onye bụbu onyeisiala ndị Ivory Coast taa, Ọ pụtara n'ụlọ mkpọrọ taa ka ọ nọchara afọ atọ n'ime iri abụọ a gụnyeburu na ọ ga-anọ. Cheta na onyeisiala ndị Ivory Coast bụ Alassane Ouattara, gbagharala ya na ihe karịrị mmadụ 700 ndị ọzọ nso nso a. N'egwuregwu, Otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke nta Naịjirịa a kpọrọ 'Falconets' na otu Haiti ga-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mbaụwa U-20 echi. Cheta na Germany ji otu ọkpụ merie ha n'egwuregwu nke mbụ ha gbara n'asọmpi a. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Otu obodo dị n'Enugwu na-atụ ụjọ na akwa mmiri ha daa, ha na ndị obodo ndị ọzọ agaghị enwezị mmekọrịta ọzọ. Akwa ụzọ Nkwe na Ezere" afirika-43933180,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43933180,Akụkọ kachasi n'abalị a: Gọọmentị Enugu steeti eziela ozi ọṅụ,Akụkọ ndị kachasị n'ụtụtụ a,"Gọọmentị Enugu steeti ewepụla ego karịrị otu ijeri naira a ga-eji kwu ndị ọrụ steeti ahụ ego ezumike nka. Ha sị na-ego ga n'abịa dịka nde narị naira kwa ọnwa bido n'ọnwa Mee. Ha ga akwụkwa ego ụgwọ ụlọ ha sị n'akpa ndị orụ weputa. Ọzọ... End of Twitter post, 1 Nzụkọ Kim Jong-un nke Nọt Korea na Moon Jae-in nke Saut Korea amịtala mkpụrụ Mba abụọ ahụ bubu nwanne ekwekọrịtala ị kwụsị esemokwu ruru afọ ịrị ise dị n'etiti ha. Ebe ọzọ na Naijiria Ụlọikpe ukwu na Legos enyela iwu ka atọghapụ Sinetọ Nwaoboshi mana ọ gaghị adị mfe. Ha nyere Nwaoboshi ụbọchị atọ iji kwụ ihe ruru naira nde iri ise ma nyekwa ụlọikpe akwụkwọ njem ya tupu atọghapụ ya n'ezie. Na akụkọ egwuregwu Onye nkuzi otu Arsenal na-apụ apụ n'oge adịghị anya kwuola na ọ chọrọ ka ọnwa ikpeazụ ya ga n'udo. Cheta na Arsenal na-akwadọ asọmpị ha na Manchester United echị Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ ụtụtụ a na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa A maghị m na Igwe Tupac ga-achake etu a" afirika-49798237,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49798237,Cosmas Maduka: Ihe mere m ejighi nwee TV na be m,Abịa na Naịjirịa Cosmas Maduka so n'ime ndị kachasi nwee ego.,"Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Maazị Maduka sị na itinye uche n'ihe ọ na-eme so n'ihe mere ya ji bụrụ onye ọ bụ taa. O kwukwara na ya enweghi TV na be ya, nke a mere na onweghi ka emume a na-eme na TV gbochie ya ime ihe dị ya n'uche. Gee ya ntị. Akụkọ ga-amsị gị:" afirika-48080624,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48080624,Onye otu ọkpa chọrọ irita olaedo n'Olympics,Abraham Ikechukwu bụ nwafo Igbo ike dị n'obi na-eme ihe nyiri ndị nwere ọkpa abụọ.,Abraham gbaaka awụ jọmpụ ogologo. Ọ nwere obi sie ike na otu ụbọchị na ya ga a bụ onye ana anụ aha ya n'ụwa niile. Nwafọ a gbara afọ iri na itoolu ji otu ọkpa awụ jọmpụ. Ọgwara BBC na ya ga-erita ọlaedo n'Olympics. Akụkọ ga-amasị gị mba-uba-55777680,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-55777680,Sunday Igboho: Buru ụzọ nwuchie Shekau na Gumi tupu ụnụ bịa ịnwuchi m - Sunday Igboho,Sunday Igboho ekwuola na nkata ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-akpa iji nwụchie ya agaghị enwe isi.,"Igboho kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ Punch gbara ya ajụjụ ọnụ, dịka ndị uweojii nakwa ndị DSS gbalịrị ịnwụchi ya n'ụbọchị Fraịde. Cheta na Sunday Igboho bụ onye kwuru na ya na-alụ ọgụ iji kwụsị mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa. Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa chebiiri Sunday Igboho n'okporo ụzọ si Legọs aga Ibadan mana mbọ ha gbara ịnwụchi ya enweghị isi. Igboho kwuru na ""ndịọrụ nchekwa Naịjirịa ga-ebugodu ụzọ nwụchie onyeisi ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau nakwa Sheikh Ahmed Gumi tupu ha abịa nwuchie m"". O kwuru sị: ""Gịnị ka m mere ha ga-eji chechie m n'ụzọ ka onye ohi?"" ""Ndị uweojii agwabeghị m bịa n'ụlọọrụ ha mụ ajụ. Gịnị meziri ha ji bịa ichechi m n'ụzọ?"" Oge a jụrụ ya ma ọ ga-aza oku ma ndị uweojii kpọọ ya, Sunday Igboho kwuru sị: ""Ha buru uzọ kpọọ Shekau na Gumi tupu ha akpọọ m. Igboho gara n'ihu kwuo na ya agaaghị agba ọzọ, nke ya ga-ezo ezo, mana ndị uweojii agaghị enwe ike ịnwuchi ya n'ala Yoruba. Sunday Igboho ekwuola na ebe ọzọ ya na-aga ebuso ndị Fulani na-achị ehi agha bụ n'Ogun Steeti. Sunday Igboho bụ onye Yoruba na-ebuso ndị ọchịehi Fulani agha na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa adọọla ndị otu ahụ aka na ntị ha chee aka ghọrọ ya n'Ogun steeti. Ya bụ nwaamadị etuola ọnụ na ya ga-aga ịchụpụcha ndị Fulanị na-achị ehi niile na steeti ahụ mgbe adịghị anya agbanyeghị na a sị na ndị agha Naịjirịa na-esozị ha na-azụ. N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, akwụkwọ akụkọ ""The Nation"" Igboho sị na ya anụla maka mkpamkpa ndị ọchị ehi ahụ na-akpa na ya bụ steeti. Ya bụ akwụkwọ akụkọ akọbụọla ka ndị agha Naịjirịa siri edugharị ndị ọchị ehi ahụ n'ọhịa n'Ogun steeti bụ ebe eboro na ha na-eti ndị mmadụ gara ịkwụsị ha ka ha ghara ịba n'ugbo ha. ""The Nation"" kwuru na Igboho sị na ọ bụ Chineke chọrọ ịzọpụta ndị Ibarapa na-aka ndị ọchị ehi mere ya bụ ihe na-eme ebe ahụ jiri pụta ihe sịte n'ọnwụ Dọkịnta Aborode. Sunday Igboho ekwuola na ihe wutere ya maka ụlọ ya a gbara ọkụ bụ maka na ọ bụ ndị Yoruba ibe ya kpara arụ ahụ. Igboho kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n'ụbọchị Tuzde. O kwuru sị: ""Mbọ m na-agba bụ iji hụ na mwakpo ndị ọchịehi Fulani na-awakpo anyị n'ala anyị kwụsịrị, mana ọ na-ewute m na ndị Yoruba ibe m na-esonyere ndị ọchịehi a iji buso m agha."" ""Ọ gbara m gharịị na ụfọdụ ndị Yoruba na-enyekwara ndị ọchịehi a aka n'igbu nakwa iwakpo ndị be anyị."" Igboho gara n'ihu kwuo na ihe mebiri n'ụlọ ya gbara ọkụ karịrị nde naịra iri ise (N50 million) Ọ gakwara n'ihu kwuo na akụkọ ndị na-efegharị na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ya, abụghị eziokwu. ""O nweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na-akwado m,"" Igboho kwuru. ""Ndị ọchịchị anyị achọghị ịma maka mwakpo na ogbugbu a na-egbu ndị nkịtị n'ime obodo dị icheiche."" ""Ya kpatara m ji alụ ọgụ a iji weta udo na nchekwa na be anyị, agaghịkwa m akwụsị ịlụ ya bụ ọgụ ruo oge ndị ọchịehi a hapụrụ ala anyị."" Etu ndị ekperima si gbaa ụlọ Sunday Igboho ọkụ BBC agaala n'obodo Soka nke dị n'Oyo steeti ịmata kpọmkwem ihe kpatara ọkụ gbara n'ụlọ Sunday Igboho, bụ nwa amadị ahụ foro ntutu taa na ndị Fulani ọchịehi ga-esiriri na mpaghara Ọdịda Anyanwụ kwapụ. Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Tuzde na ụlọ nwa amadị a agbaala ọkụ, mana amaghị ihe kpatara ya bụ ọkụ. Mana ndị bi n'okirikiri ahụ gwara BBC na ọ bụ ndị ekperima bịara n'ime abalị ma tinye ọkụ n'ụlọ ahụ. Obasanjo: Ị nwere ike zuo Naịjirịa niile ma ya bụrụ n'ịbụ onye APC Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ekperima ahụ ji ụgbọala atọ wuchie n'ụlọ ahụ n'ihe dịka elekere abụọ maọbụ atọ nke ime abalị. ""Oge anyị pụtara n'ụtụtụ a, anyị hụchara komkom 'kerozine' nakwa gaasị, ma hụkwa mgbọegbe n'ogige ụlọ ahụ."" Onweghị onye ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ merụọ ahụ na ọkụ ahụ, mana ụlọ Sunday Igboho gbapịara agbapịa. Onye mụnyere ọkụ gbara n'ụlọ Sunday Igboho? Akụkọ pụtara n'ụtụtụ a na-ekwu na ọkụ bee Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho wee mara. Bee ya ahụ dị n'ebe akpọrọ Soka n'Ibadan. Ọkụ ọgbụgba ahụ gbara dịka otu ndị gọvanọ ọdịda anyanwu nwechara ọgbakọ n'Akure ebe ha kpara maka etu a ga-esi belata ọgbaghara dapụtara maka ndị Fulani. Amabeghị etu ọkụ ahụ si malite mana onyonyo ruru BBC aka na-egosi ebe ndị mmadụ na-atụ ụlọ Igboho aka iji gosi etu ọkụ si gbarie ụlọ ya. Ndị mmenyu ọkụ biara menyụọ ya bụ ọkụ mana onweghị onye ma ma mmadụ a nwụrụ n'ime ụlọ ahụ n'ime ọkụ ahụ gbara bee Sunday. Sunday Igboho ekwubeghị maka ọdachị a n'akara twitter ya ,instagram maọbụ facebook ya. Akụkọ ka na-abịa gbasara ihe a merenu n'ikpeazụ a. Sunday Igboho ọ na-akwado Nnamdi Kanu? Sunday Igboho chụpụrụ Seriki Fulani nọ n'Oyo steeti ekwuola na ya agaghị ịkwụsị atụmaatụ ya belụ ma ndị ọchịehi niile nọ n'ọhia ha e si ebe ahụ pụọ. Igboho depụtara nke a n'akara twitter ya ma na-ekwu na o nweghị onye ga-achụpụli ha n'ala nna nna ha, katama egbuchiasịa ha mana nke a agaghị eme ka ha gbaa ọsọ n'ala ha . Igboho gakwara n'ihu kọọ ka ndị bee ha si atụzi ụjọ maka mkpampka o kwuru ndị ọchị ehi na-akpa n'ogbe ahụ. Ọ gara n'ihu wepụta ozi Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) dere na n'akara twitter ya nke mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ha abụọ a na-arụkọ. O kwuru ka gọọmenti mata na o nweghị ihe dịka ọchịchị maọbụrụ na ndị ha na-achị anọghị ya. Nke a bụ mbụ Igboho na-ekwu ihe gbasara ogbaghara dapụtara n'Igangan dị n'Oyo steeti kanmgbe okwu a malitere n'izu ụka gara aga. Etu ndị ọnụ na-eru n'okwu si gaa njem nleta ikpezi udo n'Igangan Gọọmenti Oyo steeti na ndị uweojii akpọọla oku udo n'ụfọdụ akụkụ ebe ọgbaghara dapụtara na steeti ahụ ma na-arịọ ndị ọnụ na-eru n'okwu ka ha nabata mkparịtaụka karịa ma ị na-emebisi akụ na ụba ndị mmadụ. Fatai Owoseni bụ onye ndụmọdụ gọvanọ Oyo steeti nọchitere anya ya na njem nleta ahụ riọrọ ka ndị bi n'ogbe ahụ nabata nnagide agbụru iji buso mwakpo si n'aka ndị ekperima agha. Kọmịshọna ndị uweojii Oyo steeti bụ Ngozi Onadeko kwuru okwu na njem nleta n'Igangan, Tede na Ago si na oke ọgụ a na-alụ na-ebute mmebisi ihe n'ogbe ahụ kwụsị. O kwuru ka ndị ọnụ na-eru n'okwu zukọta ka enwe ọgbakọ n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ibadan ebe a aga-ekwu etu weta udo n'ebe ahụ. Cheta na ọgbaghara dapụtara n'Igangan kamgbe otu izụka maka oke ntọrị na ogbugbu ndị ntoroọbịa kwuru na ndị Fulani na-eme n'ogbe ahụ. Ihe m hụrụ mgbe m na-agba ọsọ ndụ Igboho- Nwunye Seriki, onyeisi ndị Fulani n'Oyo steeti Otu nwa Seriki bụ onye isi ndị Fulani n'obodo Igangan akọrọla BBC ihe ha hụrụ mgbe Sunday Igboho wakporo ndị bee ha. Umar Salihu Abdukadir gwara BBC na mgbe ọ kụrụ elekere atọ ha gbapụrụ n'Igangan, ha gbagidere ọsọ ọ kụọ elekere anọ nke mgbede ha ji ruo Ogun steeti. O kwuru na ọụtụ mmadụ amaghị ebe ha nọ , gunyekwuru nna ya bụ seriki Fulani. BBC hụkwara nwunye nke mbụ Seriki Fulani aha ya bụ Mariam nke e merụrụ ahụ ebe ọ na-anwụ mmiri. Mgbe BBC gara bee ya , a hụrụ na o bu nnukwu ọnya n'ihu ya. Anyị gbaliri ịnụta n'ọnụ nwunye Seriki Fulani , o kwunwughị okwu ọfụma. Onyeisi ndị uweojii nakwa gọvanọ Seyi Makinde ga-aga Igangan dị n'Oyo steeti taa Gọvanọ Seyi Makinde bụ aka na-achị Oyo steeti, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu, nakwa ndị eze nọ na steeti ahụ ga-aga Igangan dị n'okpuru ọchịchị Ibarapa Notu ka ha wee kpaa maka etu a ga-esi weghachị udo n'obodo Ibarapa. Osote onyeisioche ndị eze n;Oyo steeti gwara ndị ntaakụkọ Punch na ha na-enwe ọgbakọ a ka ha weghachite udo n'ogbe ahụ. Cheta na ọgbaghara dapụtara n'Igangan, Ibarapa mgbe nwa amadị Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara na-azọ nwereonwe ndị Yọrụba kpọrọ ndị otu ya gaa n'ogbe ndị Fulani ịchụpụ onyeisi ha ma na-ebo ya ebubo mpụ na nrụrụaka dị iche iche. lee ihe ndị ịkwesịrị ị ma maka Sunday Igbogho Sunday Adeyemo eji Sunday Igbogho na-ewu dịka ọ gwara ndị ọchị ehi bụ ndị Fulani na Oyo steeti ka hwa kwara kwapụ. Sunday Idogho bidoro iwu dịka ya na ọtụtụ ndị mmadụ wuchiri obodo Igangan dị na Oyo Steeti. Nke a na-eme dịka onyere ndị Fulani abalị asaa isi Oyo steeti pụọ. Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Jenuwarị bụ ụbọchị ikpeazu Igbogho nyere ha. Sunday Igbogho boro onyeisi ndị Fulani na steeti ahụ bụ Saliu Kadri na ndị otu ya na-egbu ndị Youruba. Igbogho kpọrọ Fatai Aborode, Alhaja Serifat Adisa na ụmu ya na nwaeze ndị Igangan na ndị ọzo dịka ndị Fulani gburu na steeti ahụ. Lee ihe anyị ma maka okwu a Ihe Gọvanọ Oyo Steeti kwuru ma okwu a Gọvanọ Steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwuru na ya agaghị anabata ka onye ọbụla nọrọ dịka onye na-alụrụ ndị Yoruba ọgụ ma bute nnukwu ọgụ agbụrụ na steeti ahụ. Makinde kwuru sị, "" Ọ bụ ịbulite akụnụba ndị Oyo steeti kacha dịrị ọchịchị steeti a mkpa, ọgbaghara agaghị ekwe ka atụmatụ a mezuo"". Ihe ndị Fulani nọ na steeti ahụ na-ekwu Onyeisi ndị Fulani n'Oyo steeti bụ Alhaji Abdulkadir gwara BBC Yoruba na ha enweghị ebe ọzọ ha nwere ịgbaga. O kwukwara na ya bụ nghọtahe ba-ebe nsonso a. O kwukwara na ndị uweojii awụchiela maka nchekwa udo ma sịkwa ka arịọ Sunday Igboho ga obi ya dere duu. Ndị uweojii kwanụ? Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka anwụchie Sunda Adeyemo eji Sunday Idogho mara. Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi ndị Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu katọrọ ya bụ iwu." 44727340,https://www.bbc.com/igbo/44727340,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ,Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ,"Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ na mba Saụt Afrịka n'ogige anụmanụ 'South African game reserve. Ndị na-elekọta anụmanu kwuru na ha hụrụ ozu mmadụ abụọ ahụ bụ ndịnta na egbe ji n'ime ụlọ ọdụm. APC Imo steeti ga-eme ntụliaka imeụlọ Ụlọikpe ukwu nọ n'Owere, Imo steeti, akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere na steeti ahụ. Ụlọikpe nyekwara APC iwu ka ọ gbaa mbọ megharịa ntuliaka ọhụrụ na steeti ahụ. Adamu Ciroma alaa Adamu Ciroma bụ onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego nakwa onyeisi ụlọakụ etiti nke a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ, anwụọla. Ciroma dị afọ iri asatọ na itoolu nwuru n'Abuja taa ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge. Kedu mgbe mmekpa ahụ sị n'aka ndị uweojii ga-akwụsị Ezinaụlọ Igwetu Linda bụ nwata ahụ na-efe ala Naịjirịa ndị uweojii gbagburu n'Abuja na Wenezde ekwuola na ha a chọrọ ikpe ziri ezi gbasara ya bụ okwu. Nwanne ya bụ Amara Igwetu gwara BBC Igbo na ha anabataghị ihe ndị uweojii kwuru. Diego Maradona arịọla arịrịọ Onye egwuregwu bọọlụ a ma ama bụ Diego Maradona arịọla otu FIFA arịrịọ maka okwu o kwuru na a ghọgburu Ajentina n'asọmpị ha na Ingland mere n'iko mba ụwa. Cheta na Maradona dere na Twitter na ogbu-bọọlụ n' asọmpị ahụ bụ onye mere e jiri merie Ajentina na ya bu asọmpi. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise ọmere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee" afirika-47465843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47465843,Imo state: 'PDP enweghi mmeri n'Imo state' - Nwafor,BBC Igbo kpọrọ otu onye nnọchiteanya otu pati APC ka o tinye ọnụ ya n'ihe gbasara mpụtara ntuliaka ebe Inec kpọpụtara aha Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka Imo steeti.,"Dan Nwafor bụ onyeisioche APC n'Imo steeti Dan Nwafor bụbu onyeisi ndị APC n'Imo steeti gwara onye ntaakụkọ BBC na site n'ihe iwu ala Naịjirịa kwuru, na Emeka Ihedioha ekwesịghị inweta mmeri. Ọ kọwara na iwu Naịjirịa sị na tupu a kpọpụta aha mmadụ dịka onye meriri, na e kwesịrị ka o nweta n'opekatampe pasentị 25 n'ime vootu niile a tụrụ atụ n'ime ihe ruru okpuruọchịchị 18. O kwuru na onye PDP bụ Ihedioha, enwetarughi vootu pasentị 25 (25%) n'ime okpuruọchịchị 18 n'ime 27 dị n'Imo steeti, nke mere na ịkpọpụta aha ya abụghị n'usoro iwu Naịjirịa. Nwafor kwuru na dịka iwu si kwuo ya, na ihe Inec kwesịrị ime bụ ikwu ka onye PDP kachasị nweta ọnụọgụgụ vootu na onye AA na-esote ya, gaa megharịa ntuliaka nke a kpọrọ ""re-run"" na Bekee. Maka etu onye AA si na pati ha pụọ si merie karịa onye APC ha, o kwuru na ọ bụ ihe mwute na o si etu a dapụta, maka ndọrọndọrọ dị n'ime pati ha. Kedụ ọnọdụ Hope Uzodimma? Nwafor kwukwara na APC achụọla Hope Uzodimma na pati ha, maka ime ihe ha kpọrọ ""anti-party activities"". O kwuru nke a ka a jụrụ etu ha si hụta ekele maka mmeri Uzodimma kelere Ihedioha. Ka a jụrụ ya ma ha agaara akwado Uzodimma ma ọ bụrụ na ọ bụ ya meriri na ntuliaka a, o kwuru sị ""ọ bụ onye gbụpụ asọ ọ laghachi rachara ya? Anyị agaghị akwado ya"". Etu ndị mmadụ si nabata mmeri PDP Ka a na-eche mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, ụfọdụ ebidola nwewe aṅụrị. BBC Igbo hụrụ ebe ọtụtụ mmadụ tinyere aṅụrị ha n'igwe Facebook: Lekwa ihe ndị mmadụ mere ihe ngosi achụmnta vootu Uche Nwosu n'Owere: Isi ụtụtụ ebe elekere anọ n'ụbọchị Monde nke iri na otu n'ọnwa Maachị n'afọ 2019 ka ndị na-anọchite ndị pati ndọrọndọrọ n'ebe a na-agụpụta mpụtara apụrụla akwụkwọ e ji akpọpụta mpụtara, dọkachaa ya ma malite ịlụ ọgụ n'ime 'collation center' n'Imo steeti. Ọgbaghara dapụtara n'ọgbọ ahụ ka otu nwoke bilitere ọtọ na-aba mba maka etu e si akpọpụta ya bụ mpụtara. O ji iwe dọrọ akwụkwọ n'elu tebulu ahụ, dọkaa ya. Nke a mere ka onye ọzọ dọrọ akwụkwọ ọzọ dọkakwaa ya. Ndị mmadụ biliteziri ọtọ, kụkọtawa isi, mba a na-arị ibe ya elu. Tupu ihe a emee, otu nwoke jụrụ jụwaa isi ka otu onye nọ na-ekwu ka a gaa ezumiike makana ọ ""chọrọ ịṅụ ọgwụ""; nwoke ahụ kwuru sị na ọ bụrụ na a gaa n'ihu zuo ike, na ihe ga-emebi mgbe ha na-alọghachi. Lee ka o si mee n'ihe nkiri a. Lee ebe ndị Imo na-alụ ọgụ maka mpụtara ntuliaka I lee na Facebook anyị, ị ga-ahụ ka e si na-akpọpụta mpụtara n'Imo steeti tupu ọgụ ebido. Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti pụtara binye aka ha na wọọdụ ha dị iche iche. Emeka Ihedioha na-azọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti, na nwunye ya binyere aka na wọọdụ ya dị na Mbụtụ, Mbaise. Ha kwuru na obi dị ha ụtọ na Inec rụrụ ọrụ ha nke ọma. Uche Nwosu na ọdịnịhu Imo steeti: Uche Nwosu kpọkuru ndị Imo ka ha pụta n'igwe sonye n'ịhazi ọdịnihu Imo steeti maka ọdịnma ha na ọdịnma ndị ntoroọbia. Taa ka anyị ga-enwe nkwekọrịta gbasara ọdịnihu Imo steeti - Uche Nwosu O kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ na-akparịtaụka oge ọ tụchara vootu ya. Hope Uzodinma na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti n'okpuru pati APC atụọla vootu nke ya. Uzodinma na Nwosu so na mmadụ abụọ ndị mmadụ na-atụ anya ka ha mara onye ga-enwe mmeri na ntuliaka a. Uche Nwosu atụọla vootu n'Eziama Obire. Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati AA. Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ tiri mkpu n'elu Twittter ya sị na ọ ka nọkwa n'ọsọ a, dịka ndị mmadụ na-ebugharị akụkọ na ọ pụọla na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ka a na-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu taa, ndị Imo na-eche ịma onye ga-achị ha afọ anọ ọzọ. Ọ bụ n'ụbọchị Satọde 9 nke ọnwa Maachị ka a ga-eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ. Ọtụtụ mmadụ pụtara ịzọ ya bụ ọkwa dịka e nwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị kariri iri asaa n'ọgbọ a. Ngụkọ otu webusaịt mere ịji mata uche ndị mmadụ gbasara ndị ha ga-akwado na ntuliaka a gosiri ndị a họpụtara n' Abịa nakwa n'Imo. Lee ndị welitere isi na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti abụọ ndị a gbara onwe ha agbataobi. Abia 1) Okezie Ikpeazu - PDP Okezie Ikpeazu bụ aka na-achịkọta Abia steeti ugbua. Ọ na-azọ ịchị ya na-agba nke abụọ n'afọ 2019. Ikpeazụ asaala Otti: Nyocha onwe gị tupu inyocha anyị N'ozi oji achụnta vootu, ọ na-egosi ndị Abia ihe o merela ha na-agba nke mbụ ya ma na-ekwu na ọ ga-emekarị ya ma ọ zọta ya ọzọ. 2)Alex Otti - APGA Alex Otti gbara afọ 53 na-azọ ọkwa ịchị Abịa steeti na ntuliaka 2019. O kwenyere na ọ meriri ntuliaka nke afọ 2015 mana e zunarịrị ya bụ mmeri. O kwuru na ọ ga-atọghapụ ndị Abia n'aka ọchịchị nchịgbu. 3) Uche Ogah - APC Uche Ogah dị afọ 49 bụ onye ji ego achụ ego n'ihe gbasara mmanụ agbịdị. N'afọ 2015, ọ zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru otu PDP mana ọ gbahapụrụ ha fee na otu APC. Ọ kọwara na o mere nke a n'ihi na ohere onye kwuo uche adịghị na otu PDP. 4) Nkoro Joseph Ngozi - YPP Joseph Nkoro bụ onye ka bụrụ nwata n'ime ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia steeti ebe ọ dị afọ 36. O kwuru na ihe kachasị ya mkpa ọ ga-eme ma ọ zọta ọkwa gọvanọ bụ ịkwụ ndịọrụ ụgwọ ọnwa ha. Imo 1) Uche Nwosu - AA Ọkwa gọvanọ Uche Nwosu na-azọ bụ nke nwere akụkọ na-eso ya kemgbe o kwuputara na ọ ga-azọ. Ihe butere ya bụ n'ihi na Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo nke na-apụ apụ bụ ọgọ ya nwoke. Ya mere na o butere ọgbaghara n'etiti pati ndị APC ma rukwa ụlọikpe. Ugbua, Nwosu na-azọ zi ọkwa gọvanọ n'okpuru pati AA dịka ọ hapụrụ APC maka okwunaụka. 2) Ifeanyi Ararume - APGA Ifeanyi Ararume bụbu Sinetọ na-anọchị anya Imo North (Okiwge) n'ụlọomeiwu ukwu nke o meriri n'afọ 1999. Ọ pụtara n'afọ 2007 ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP mana esemokwu malitere n'etiti ha nke ruru ụlọikpe ma mee ka PDP chụpụ ya na pati ha. Ugbua, ọ na-azọ ya bụ ọkwa n'okpuru otu APGA. 3) Uzodinma Hope - APC Hope Uzodinma bụ kwa sinetọ ọzọ na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti. Ọ zọtara oche Ọrlu(Imo West) n'ụlọomeiwu ukwu n'afọ 2011. Uzodinma na Uche Nwosu zọrọ onye ga-anọchị anya APC n'Imo steeti dịka ha kewara agba abụọ n'ime APC n'Imo steeti. Inec na ụfọdụ ụlọikpe tinyere ọnụ n'okwu dịka e mere ntuliaka imeụlọ abụọ rue mgbe Uche Nwosu fepụrụ na APC fega otu AA. 4) Emeka Ihedioha - PDP Emeka Ihedioha bụ onye ọrụugbo nke ukwu nwekwara ụfọdụ ụlọoriri nakwa ahịa mmanụ agbịdị. Ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu nke nta n'afọ 2003 ịncọhị anya Abor-Mbaise-Ngor Okpala. O mechara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta site n'afọ 2011 rue afọ 2015. Ọ malitere ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP dịka o meriri ntuliaka imeụlọ nke ha haziri. 5. Ikedi Ohakim - Accord Ikedi Ohakim bụ aka chiburu Imo steeti site n'afọ 2007 rue 2011 n'okpuru otu PPA. Tupu e mee ntuliaka ahụ na 2007, o si n'otu PDP gbapụta banye na PPA. O kwuru na Imo anwụchala anwụ, na ọ bu ya mere oji azọ ọkwa agba nke abụọ iji zọpụta ya. O siri na otu PPA febanye na PDP ma siri ebe ahụ banyekwa n'otu AA ebe ọ nọ azọ ọkwa gọvanọ ugbua. Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-44313468,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44313468,Etu ndị ọwụwa-anyanwụ si mee 'Ụbọchị Biafra' ụnyaahụ,"Ụbọchị Mee 30 nke 1967 bụ ụbọchị Chukwuemeka Ojukwu kwuru na mba ọzọ akpọrọ Biafra. Ụbọchi ahu bụkwa oge ndị di icheiche na-akwado Biafra wepụtara ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ha iji cheta mbido Biafra na ndị nwụrụ n'agha agafeela, mana ndị mmadụ e gere ha ntị?","Ụzọ Faulks dị n'Aba tọgbọrọ chakoo nke mere na ndị mmadụ nwere ike gbaa bọọlụ ebe ahụ N'afọ a, maka mmachị ndị gọomentị machịrị Indegineous People of Biafra (Ipob) na ọchi cho a na-acho onyeisi ha bu Nnamdị Kanu mere ka ndi mmadụ tụwa anya etu emume ncheta Biafra ga-adị. Lee otu ụbochị ahụ siri ga na steeti dị icheiche na ụwụwa anyanwu Naịjirịa: N'Enugwu steeti Ụfọdụ ndị nọ n'ụlọ ebe ndị ọzọ kwụdosiri ike ma mepee ụlọ ahịa ha ebe ndị ọrụ bekee gakwara ọrụ. Ụlọakụ gbapere ebe ụlọọrụ ndi gọọmentị nọkwa ọrụ. Ụfọdụ ahịa gbapere, mana Ọgbete, bụ nnukwu ahịa n'Enugwu azụghị. Nsụka esoghi mee ya bụ nọrọ n'ụlọ. N'ụzọ Ogui ụfọdụ ndị emepeghị ahịa ha, ebe ndị ọzọ mepere naanị nke dị n'ihu ụlọ ha Ahịa kacha nnukwu n'Enugwu bụ Ogbete dị ka ebe agbara ọsọ. Naanị mkpụrụ mmadụ ole na ole mepere ahịa. N'Abịa steeti Ebe ndị bi n'Aba kwere nọrọ n'ụlọ, ndị bi n'Umuahia bụ isi obodo steeti ahụ gawaara onwe ha ka e nweghị ihe na-eme. Ndị ụlọakụ na ndị ọrụ bekee mepere n'Umuahia. Ụlọakụ dị n'Umuahia rụrụ ọrụ etu ha kwesịrị Ụzọ Faulks dị n'Aba tọgbọrọ chakoo nke mere na ndị mmadụ nwere ike gbaa bọọlụ ebe ahụ N'Anambra steeti N'agbanyeghị na ndị nọ n'ọchịchị n'Anambra nyere iwu sị na onye ọbụla ga-aga ọrụ ya etu o kwesịrị, ndị mmadụ egeghị ha ntị ma nọrọla onwe ha n'ụlọ. Nnewi na Onịca sonyere na nọrọ n'ụlọ a, mana Ọka, bu isi obodo Anambara, esonyeghi ruo n'isi. Akwa mmiri Niger tọgbọ chakoo n'agbanyeghị na ọ bụ ebe ụgbọala na-ejukarị na-ebute ịga nwayọ nwayọ Okporoụzọ dị n'Ọnịcha tọgbọ chakoo N'Imo steeti Na steeti niile dị n'ala Igbo, Imo steeti so n'ebe ọtụtụ ndị mmadụ ejịghị ị nọ n'ụlọ were mee emume ncheta Biafra. Kọmishọna ndị uweojii kwuru na e nweghị ihe dị otu ahụ mere n'Imo steeti. Ndị mmadụ juru n'ụlọakụ dị n'Owere Ụzọ cherubim Junction dị na Wetheral n'Owere kworo ekwo maka na ndị mmadụ pụtara n'ezi Na Rivas steeti Ụfọdụ ahịa na Rivas steeti emepeghị, mana ụlọakụ na ndị ọzọ zụrụ ahịa. Eke Obigbo dị na Rivas steeti tọgbọrọ chakoo ka ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ Ahịa ọgbọ osisi dị na Obigbo emepeghị maka na ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ N'Ebonyi steeti N'ọtụtụ akụkụ Ebonyi steeti ndi mmadu putara etu ha na-eme na mbụ maka na gọvanọ ha bụ Dave Umahi nyere iwu sị na onye ọbụla ga-agara onwe ha mkpa ha ma gakwaa ọrụ ha etu o kwesịrị. Mana ihe akara ndi Radio Biafra dere na Twitter na-atu aka na o nwere ndị sara oku ndị nkwado Bịafra ma mekwa etu ha kwuru. Lee etu osiri ga ụnyaahụ: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52165482,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165482,5G and Coronavirus: 5G ọ na-ebute coronavirus?,Ọtụtụ na-ekwu na 5G na-ebute ọrịa coronavirus.,Mana taata ka anyị nyobaa mara ma 5G ọ na-ebute coronavirus. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chimezie Ucheagbo 44319389,https://www.bbc.com/igbo/44319389,Johesu akpọghachila ndị ọrụ ahụike,Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike na Naijiria bụ Joint Health Sector Union (Johesu) na bekee agwala ndị otu ha ka ha lọghachi n'ọrụ echi bụ ụbọchị mbụ ọnwa Juunu.,"A kpọchiri ụzọ ụlọọgwụ ahụ iji kwụsị ọbịbịa ndị mmadụ Johesu kwupụtara nke a ụbọchị taa ka ha mechara ọgbakọ ndị isi ha n'Abụja. Akwụkwọ ozi ha depụtara oge ha mechara ọgbakọ ahụ kwuru sị, ""Dịka ndị isi nwechara mkparịtaụka, ha kwekọrịtara ikwụsị taa bụ Mee 31 n'ihi obi ọmịiko ndị otu anyị nwere n'ahụhụ nke dị ọha Naijiria na-ata ya na iji nye ohere maka mkparịtaụka maka udo nke ga-ebido ụbọchị Juunu 4"". Ha katọrọ gọọmentị maka ịhapụ imejupụta ọchịchọ ha. Cheta na Johesu gbara abụbọ ọrụ abalị iri anọ na atọ (43) gara aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43552025,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43552025,Iheanacho apụọla n'asọmpi Serbia na Naịjirịa,Nwaafọ Naịjirịa na-agbara ndị Leicester City bọọlụ bụ Kelechi Iheanacho na onye nchekwa bọọlụ otu egwuregwu Bursaspor bụ Shehu Abdullahi agaghị eso sọọ mpi taa ka Naịjirịa na Serbia ga ezute n'ama egwuregwu bọọlụ taa.,"merụru ahụ n'aka Onyendu ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuru na Iheanacho meruru ahụ n'aka nri ya. Iheanacho so gbaa bọọlụ enyi na enyi Naịjirịa na Poland gbara na Wroclaw mana ewepụrụ ya tupu a gbacha. Iheanacho bụ onye gbabụrụ otu Manchester City bọọlụ esoghị ndị ọzọ mee nkwado egwuregwu ha na Serbia. ""ịheanacho apụọla, mana ọpụpụ ya ga enye ndi ọzọ ohere ibata gosi ihe ha ga emenwu,"" Rohr kwuru unyaahu. Rohr kwukwara na otu n'ime ndị oche gọọlụ ha enweteghi akwụkwọ ikike ọ ga eji banye UK, bụ ebe a ga-asọ mpi a. ""Otu nime ndi oche gọọlụ anyi nwere nsogbu akwukwọ mbata mana Ezenwa na Uzoho bụ ndị nọ n'ọgbọ ugbua na-enye m oṅu,"" Rohr kwuru. Super Eagles jiri 1:0 merie Poland n'asọmpị ha gbara ụbọchị Fraịdee. A na-enwekwa olilenanya na ha ga-eme ọfụma na nke ha na Serbia taa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44544320,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44544320,Ụmụnwaanyị Abịa achọghịzị mgbere nwa na akwụna cha cha,Ụmụnwaanyị Abịa steeti kpokotara onwe ha ọnụ wee rịọ ndị uweojii na steeti ahụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ma kwụsị mgbere ụmụaka nakwa ụlọ ebe a na-amụ ụmụaka e ji atụ mgbere nke na-amụbanye na steeti ahụ.,"Ihe ndị ọzọ ha rịọkwara bụ ka a kwụsị mmekpa ahụ nke a na-emekpa ndị mmadụ na steeti ahụ, nwakpo ụmụnwaanyị na akwụna Ụmụnwaanyị ahụ kwuru na arụ ndị a a na-emeso ụmụnwaanyị nakwa ndị ọzọ na-emetọ ala Naịjirịa. Ha rịọrọ ndị uwojii na steeti Abịa ka ha kwalite ebe ha na-eleta ụmụaka na ụmụnwaanyị nke a kpọrọ Juvenile and Women Center (JWC) na Bekee site n'imalite ụlọọrụ ga na-eme nyocha pụrụiche ma na-etinyekwa uchu na mkpesa gbasara ụdị arụ ndị ahụ ịhụ na ndị na-eme ya anaghị ala n'efu. Onye ndu ụmụnwaanyị ahụ bụ nwunye aka na-achị Abịa steeti bụ Nkechi Ikpeazu na-arụ ọrụ iji kwụsị mmekpa ahụ megide ụmụnwaanyị na ndị na-anapụ ụmụnwaanyị oke na ugwu dịrị ha. N'okwu nwaanyị Ikpeazu gwara Anthony Ogbizi bụ kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ, ""Njem anyị bụ ịgba ndị uweojii ume ka ha na-eme nyocha banyere mmegide a na-emegide ụmụaka na ụmụnwaanyị ọsịsọ nakwa ịhụ na ndị na-eme ha agahị ala n'efu.'' ""A na-akwanye ụmụanyị n'akwụna, na-awakpo ha ma jiri ha na-amụ ụmụ e ji atụ mgbere ebe a na-etikwa ụmụnwanyị ihe ma na-emetọ ha, ụfọdụ oge, a na-egbu ha na-ebe dị icheiche.'' ""Anyị ma na ndị uweojii na-anwa ike ha ma na anyị na-agba ha ume ma na-akwado ha ka ha mekwuo iji jide ndị na-akpa arụ ndịa maka na ọ bụ ihe ịgba anya mmiri na ụfọdụ oge, ndị na-akpa arụ a na-ala n'efu maka na e nweghi ọkpụrụkpụ ihe ha ji aka iji jide ndị ahụ. Iji kwado ndị uweojii ahụ, ọ nyere ha igwe kọmputa na akụrụngwa ya nakwa ụfọdụ akwụkwọ gbasara oke na ugwu ruru ụmụnwaanyị na ihe ndị ọzọ. Na nzaghachi, kọmishọna Ogbizi kwere ụmụnwaanyị ahụ nkwa na ha ga-eleba anya na arịrịọ ha maka ọdịnaihu steeti ahụ. Nwunye Ikpeazu bụ site n'atụmatụ ya nke ọ kpọrọ ''Vicar Hope Foundation'' na Bekee ka o ji enye aka iweghachite olileanya nye ụmụnwaanyị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43505474,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43505474,"N'Enugwu, onye NSCDC egbuola mmadụ atọ n'Enugwu",Ihe dịka mmadụ atọ bụ ndị nwụrụ anwụ oge onye ọrụ nchekwa nke akpọrọ NSDC n'aha ịchafụ gbara egbe ụgbọala ha nọ n'ime ya.,"Gọọmentị nyere ndị NSDC ikike ibu egbe afọ ole na ole gara aga Akụkọ kwuru na ihe ọdachi a mere na Miliki Hill dị na Ngwo n'Enugu steeti. Ụgbọala ahụ nwuru ọkụ ma dakwasị ndị njem. Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ọnụ na- ekwuru ndị uweojii na Enugu steeti bụ Ebere Amaraizu, o kwuru n'ezie na ya bụ ihe mere. Ma kwukwa na ha na-enyocha ya ihe mere. ""Anyi nwetara ozi na onye civil defensi agbaguru ndị mmadụ na Miliki Hill dị n'Engwu. Anyi na-enyocha ya."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43781294,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43781294,Kenya Airways achụọla ndị ọrụ Naịjirịa ha,Kenya Airways chụrụ ihe ruru mmadụ 22 n'ime ọnụọgụgụ mmadụ dị 26 ndị Naịjiria na-arụrụ ha ọrụ na ngwụcha izuụka gara aga.,Kenyan Airways ekwubeghị ihe kpatara ha jiri chụọ ndị a Akụkọ kwuru na e nyere ha akwụkwọ ịchụ ha n'ọrụ tupu izuụka ọhụrụ a ebido ma kwuo na ọ bụ sọsọ mmadụ anọ na-arụrụ ha ọrụ ka ji ọrụ na-ebe ahụ. Ngalaba na-echekwa oke ruru ndị ọrụ ụgbọelu akpọrọ (NAUTE) n'aha ịchafụ kwuru na ha nyere ndị ahụ achụrụ sọ ụgwọ ọnwa ọtụ ọnwa na ya mere iwe ji ewe ha. Onyeisi ha bụ Olayinka Abioye kwuru na ọ gaghị ekwe ka nke a gaa n'iru. Mbọ niile BBC Igbo gbara ị nweta Kenyan Airways n'ekwentị amịtaghị mkpụrụ. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-43440608,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43440608,Enugwu na-akpọtu maka njem nleta Fayose bịara,Ayo Fayose bụ Gọvanọ na-achị Ekiti steetị gara ụnyaahụ ịleta Gọvanọ ibe ya bụ Ifeannyi Ugwuanyị nke na-achị Enugu.,"'Gburugburu' ka a na-etu ya gosiri Fayose ọtụtụ ebe n'Enugwu Akụkọ kwuru na Ugwuanyi nabatakwa ya Fayose mgbe ya na ndị so ya rutere Enugwu. Ka ha nwechara mkpakọrịta, ha malitere gagharịba na gburugburu Enugwu ebe ndị nso Ugwuanyị na-etu ya aha na-akpọ ya 'gburugburu' Gọvanọ Fayose kwụsịrị n'otu ahịa zụta karọtụ ma rịọ kwa mmiri ọ ga-eji sacha ya. Lee ihe mere ebe ahụ n'ime ihe onyonyo a: End of Twitter post, 1 Akụkọ ga amasị gị:" afirika-44312694,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44312694,Super Eagles etinyela aha Carl Ikeme na ndị ga-aga Rọshịa,"Carl Ikeme bụ onye otu ndị egwuregwu Naịjirịa bụ Super Eagles na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa ọbara ọ na-arịa (nke bekee kpọrọ Leukaemia), ka onye nchịkọta ha Gernot Rohr na-ekwu na ọ ga-eso na ndị aha ha ga-abanye n'akwụkwọ ndị ga-aga Rọshịa maka iko mba ụwa.","Carl Ikeme ritere ihe akpọrọ 'ọkacha agba n'egwuregwu' mgbe Naịjirịa malitere njem iko mba ụwa Itinye aha Ikeme ga-abụ maka nkwanye ugwu dịka na ọ bụ onye gbara mbọ ọfụma, nakwa onye kwesịrị ịbụ onye oche goolu nke mbụ ma ọ bụrụ na ahụ siri ya ike. Ikeme, dị afọ 31, chọpụtara na ọ nwere ọrịa ọbara ka ndị otu egwuregwu ọ na-agbara bọọlụ bụ Wolves na-akwado ịsọmpị n'afọ gara aga. Ikeme agbaghị bọọlụ chachaa maka ọrịa. Wolves mechara rite mmeri nke nyere ha mbuli elu ma kpọbanye ha na Premier League. Nke a agaghị abụ mbụ ndi Super Eagles na-enwe onye etinyere aha maka ikwanye ugwu. N'iko mba ụwa nke 2002 Naịjirịa tinyere aha Peter Odemwingie ka onye nke 24 ha, dị ka ha mekwara Tijani Babangida n'afọ 1998. Carl Ikeme nwereike soro ga Rọshịa, mana ọgaghị eso sọ mpị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-53777999,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-53777999,US Election 2020: Donald Trump ekwela ka amalite usoro nyefe ọchịchị,Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwela ka ebido usoro mgbanwe ọchịchị site n'aka ya rue na nke Joe Biden.,"Joe Biden has been elected America's 46th president N'otu aka ahụ o kwusiri ike na ọ ka ga-agbagha mpụtara ntụliaka ọkwa onyeisiala ahụ emere n'ọnwa Novemba. O kwuru na ngalaba ọ dịịrị ịme nneyefe ahụ nwere ikike ịmalite ọrụ ebe ha na-ekwu na ọ bụ Joe Biden ka ha hụrụ dịka onye meriri ntuliaka ahụ. Ndị otu Biden anabatala ozi a n'ụzọ obi aṅụrị dịka ha na-akwado nnyefe ahụ ga-eme n'ụbọchị iri abụọ nke Jenụwarị. Cheta na onyeisiala Donald Trump chụrụ onyeisi ụlọọrụ Cybersecurity and Infrastructure Security Agency(Cisa) bụ Chris Krebs maka okwu o kwuru gbasara mpụtara ntuliaka onyeisiala Amerịka nke Trump sị na o zịghị ezi. Nkea na-eme dịka Trump jụrụ ịnabata mpụtara ntuliaka onyeisiala mba Amerịka nke ụfọdụ ngalaba na-ekwu na ọ bụ Joe Biden meriri ya n'ihi na ọ na-ebo ebubo na enwere nrụrụaka na ya bụ ntuliaka. Ọ bụ site na ihe ndị ụlọọrụ Cisa depụtara na websaịt ha nke ha na-akpọ 'Rumour Control' ebe ha depụtara ihe ha kpọrọ akụko asị nke gbasara ntuliaka mba Amerịka. Dịka o si di, ọtụtụ ihe Trump na-ekwu maka mpụtara ntuliaka ahụ ka ya bụ Websaịt kwuru na ọ bụ asị. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ igwe kọmpụta akpọrọ Hammer na Scorecard bụ ihe ndị mmadụ ji metọọ nrụrụaka mba Amerịka. Kama Krebs na ụfọdụ ndị ọrụ ọzọ na goọmentị Amerịka na-ekwu na ọ bụghị eziokwu. Dịka o sị dị, ihe Chris depụtara n'akara twitter ya gosiri na ọchụchu achụrụ ya ewuteghị ya ma ncha. Onye bụ Chris Krebs Chris Krebs rụburu ọrụ dịka otu n'ime ndị isi ụlọọrụ MicroSoft. Krebs rụru ọrụ oge a na-ebo mba Rushia ebubo na ha tinyere kaka na ntuliaka mba Amerịka nke afọ 2016. Ọ bụ ya bụ ntuliaka ka Donald Trump si bata ọchịchị. Mmeri Joe Biden n'obodo Geogia, Gịnị ka o pụtara? Joe Biden emeriela obodo Georgia na ntuliaka onyeisiala mba Amerika. BBC na-akọwa na ọ dịka ọ bụ Biden bụ onye mbụ bụ onye otu Democrat meriri ntuliaka onyeisiala n'obodo ahụ. Nkea pụatara na Biden enweela ọnụ ọgụgụ votu narị atọ na isii (306). A na-atụanya na Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka ga-emeri n'obodo North Carolina nke ga-eme ka ọnụ ọgụgu votu ya bụrụ narị anụo na iri abụọ na atọ (232). Joe Biden ekwuola na ọ bụ ihe ihere dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekweghị ịnabata mmeri emeriri ya na ntuliaka onyeisiala mba ahụ. Na-agbanyeghị ọnọdụ Trump, Biden na-ekwu na enweghị ihe ga-egbochi ọchịchi ibanye ya n'aka. N'aka nke ọzọ ka Donald Trump na-ekwu na ọ bụ ya meriri ya bụ ntuliaka kama na ọ bụ ndị ụlọ ntaakụkọ na-ekwu na ọ bụghị ya meriri. Dịka ọ dị ugbua, ewepụtabeghi mpụtara ntuliaka Amerịka n'uju ya dịka a ka na-agụ ụfọdụ votu. Ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Desemba ga ọ ga-apụta n'uju dika ngalaba US Electoral College ga-enwe nzụkọ ha. Joe Biden bụ onye akpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka Amerịka 2020 ekwuola n'okwu mbụ ya n'ọkwa ahụ na oge a bụ maka ọgwụgwọ Amerịka. O kwekwara nkwa na ọ gaghị etisaa kama ọ ga-ejikọ ndị Amerịka. Ọ rịọkwara ndị nso nso onyeisiala Donald Trump ka ha nye udo ohere ka ọ chịa n'etiti ha niile. Biden meriri onyeisiala Trump ugbua dịka ọ nwetara vootu 270 bụ akara nturuugo onye ga-abụ onyeisiala mba Amerịka. Trump ka na-agbagha mmeri Biden. Mmeri a mere Trump onyeisiala mbụ chirila agba mbụ n'Amerịka kamgbe afọ 1990. Ndị nkwado Trump agaala ụlọikpe mana ndị ọrụ ntụliaka kwuru na o nweghị ihe gosi na nrụrụaka dị na ntụliaka nke ọkwa onyeisiala mba ahụ. Ihe Biden kwuru na bee ya dị Delaware dabara n'isiokwu atọ a: Donald Trump ka na-agba isi akwara maka onye meriri ntuliaka Amerịka 2020 Onyeisiala Amerịka ụgbua bụ Donald Trump jisike agbagha ya bụ mpụtara n'akara Twitter ya. O boro ndị gụkọrọ vootu ebubo nrụrụaka ma kwuo na ọ bụ ya meriri ntụliaka ahụ hoo haa. US Election 2020: Joe Biden emeriela na ntuliaka onyeisiala mba Amerịka Joe Biden emeriela na ntulịaka onyeisiala mba Amerịka dịka ọ meriri onye nọ dịka onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump. BBC na-atụanya na Biden emeriela isi sekpụ ntị na ya bụ ntụlịaka nke bụ obodo Pennsylvania dịka ọ gafere akara 270 bụ akara ntụruugo onye ga0abụ onyeisiala mba Amerịka. N'aka nke ọzọ ka ndị otu Trump na-ekwu na ha anabataghị ha bụ mputara ntuliaka. Mkpebi BBC na ọ bụ Biden meriri sitere na mpụtara a na-agụpụtabeghị sitere na steeti ndị gụcharala Votu ha ma gụnyere mpụtara sitere na steeti Winconsin ebe ha ka na-agụ votu ha. Lee etu ha si kwụrụ Ndị isiala ụfọdụ mba n'ụwa na ezitere Joe Biden ozi ekele Onyeisiala mba Briten eziterela Joe Biden ozi ekele Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson eziterela Joe Biden ozi ekele dịka o merịrị na ntuliaka onyeisiala mba Amerịka. O kwuru sị "" A na m atụanya etu mụ na gi ga-esi rụo ọrụ nke ọma"". Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron Onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo Amụma eburu n'isi Donald Trump Onyeisi ekpere Donald Trump ma bụrụkwa onye mgbasa oziọma a ma ama bụ Paula White-Cain sị na ya huru ndị mụọozi si mba Afrika nakwa Ọdịda anyanwụ nke Amerịka ka ha na-abịa inye Trump mmeri. White-Cain kwuru nke a n'ekpere o kpere n'isi Trump maka mmerị ntuliaka onyeisiala mba Amerịka na-aga n'ihu ugbua. N'ekpere ya, Paula White kwuru sị,"" Anụrụ m mkpu mmeri. Dinwenụ si na o mezuola."" "" Ndị Mụọozi si Afrịka, Saụt Amerịka na-abịa iweta mmeri."" Trump etinyela akwụkwọ n'ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka na Naveda Dịka Trump ji otu ọkpa kwụrụ na ntuliaka onyeisiala mba Amerịka, o tinyela akwụkwọ n'ụlọikpe maka mpụtara ya bụ ntulika na steeti Naveda. Ụfọdụ ihe ọ na-ebo gụnyere ihe ndị ọzọ okwuburu na mbụ na-achịtaghị aja nke gụnyere ịkwụsị ịgụ vootu kpamkpam, dịka akụkọ ndị ABC News buru. Trump na-ebo na ""enwere mgbaokpuru na ntuliaka emere na Clark County nakwa usoro ha ji anabata igbe eji atụnye vootu adabaghị"". O kwukwara na o nwere ihe ruru mmadụ puku atọ bụ ndị ekwesighị itu vootu bụ ndị tụrụ. Mana ọnwebeghị ihe akaebe o gosiri iji kwado ebubo ndị a. Trump na-etikarị mkpu nruruaka na mgbaokpuru na steeti ebe ọ chịtaghị aja maọbụ ebe vootu ya na ada ada. Na Nevada, ebe ọnụọgụ Biden di elu, ndị otu Trump na-eti mkpụ ka agụrụ vootu na-aga n'ihụ n'olileanya na ha ka ga-enweta vootu Trump ndị ọzọ agụbeghị. N'ụbọchị nke atọ ọnwa Nọvemba ka ndị mmadụ ga-ekwu ka Donald Trump a ka ga-anọ n'obieze ndị Amerịka ha kpọrọ 'Whitehouse' ruo afọ ọzọ na-abịanụ. Ọ bụ Joe Biden nke Democratic Party na Trump bụ onye Republican Party ga-ama ya bụ aka. A maara Biden dịka osote onyeisiala Amerịka gara aga bụ Barak Obama, mana ya bụ nwaamadị ataala ọjịụwa na ndọrọndọrọ ọchịchị mba US kemgbe 1970. Dịka ya bụ ntoliaka na-abịa nso, ndị ọrụ nchọcha ga-na agba ndị mmadụ ajụjụ ịmata onye ọ dị ka ọ ga-emeri na ya bụ ntụliaka. Mpụtara nke Frịade Mpụtara nke Tọzde Ka o si kwụrụ ugbua na ntuliaka Amerịka Anyị ga na-ewetere gị ihe ha chọpụtara nke ga-enyere gị aka ịmata mbe abụọ nke bụ oke n'ime Trump na Biden. Kedụ ka mmadụ abụọ a na-azọ ọkwa onyeisiala si eme n'Amerịka? N'ezie, ọnụọgụ ndị ọrụ nchọcha a abụghị ụzọ kacha mma iji mara onye ga-emeri na ntuliaka maka na nke e mere na afọ 2016, nchọcha kwuru na ọ bụ Hillary Clinton ga-emeri mana ọ mechere darụọ ala. Ihe kpatara ya bụ maka na mba Amerịka na-eji usoro ha kpọrọ 'electoral college' ekwu onye ga-emeri. Nke a pụtara na ọbụghị onye kacha nwee ọnụọgụ na-emerị. Enwezụga nke a, ọnụọgụ Joe Biden nọ n'elu kemgbe mbido afọ a. Ya na Trump nọ nhata nha na pasent, ebe ojikwa pọint iri (10) aga Trump. Onye nọ n'ihu na 'poll' Amerịka niile? Ndị Demokrat Biden 52% Ndị Repọblikan Trump 44% Akara ihe na-ewu na-egosi etu ndị mmadụ chọrọ isi tuọ vootu site na poll' n'ọtu n'otu Ebumnuche etu esi chụọ ịtụ vootu site na 'poll' n'otu n'otu 30 days until Ụbọchị ntuliaka Mgbakọ 'poll' niile nke BBC na-eme na-ele 'poll' n'otu otu n'ime abalị iri na anọ gara aga ma ji ya wepụta ihe na-ewu, dịka ebe ihe kwụọ ma agbakọchaa ha niile ma kee ụzọ abụọ. Otu mgbe a n'afọ 2016, odoghị anya onye ga-emerị n'ime Trump na Hillary Clinton dịka ọnụọgụ gosiri maka na ihe ha abụọ ji aga onwe ha erijughị afọ dịka ntuliaka na-akpụdewe. Kedụ steeti nwereike ikwu onye ga-emeri ntuliaka a? Dịka Oriakụ Clinton si mụtara, ọnụọgụgụ adịghị oke mkpa karịa steeti ebe atụrụ votu. Ọnwere steeti n'Amerịka bụ ndị nkwado ndị patị abụọ a ha nhata nha nke bụ na mmerị otu onye bụ agbaekpere chi. Ọ bụ na steeti ndị a ka ha kpọrọ 'Battle ground state' bụ ebe a na-emerị maọbụ dakwala ya bụ ntuliaka. Kedụ steeti ndị a bụ ọgbọọgụ? A bịa n'usoro 'electoral college Amerịka na-eme na ntuliaka onyeisiala, a na-enye steeti niile ụfọdụ votu dịka ha ha n'ọnụọgụ ha. Ha nwere votu dị 538 ịnye ndị mmadụ. Onye nwetere votu 270 nwe mmerị. Steeti ụfọdụ ka nwee votu 'electoral college' maka na ya ka n'ọnụọgụ. Gịnịdị bụ 'electorla college'? Kedụ ọnye na-achị n'ọgbọọgụ a? Ka ọ dị ugbua, Joe Biden na-achị n'ọgbọọgụ a mana ụzọ ka tereaka nke bụ na ihe nwere ike ịgbanwe ngwa ngwa, ọkachasị n'aka Donald Trump. Ọnụọgụ na-egosi na Joe Biden bụ Eze na Michigan, Pennsylvania na Wisconsin - steeti atọ bụ ebe Republicans ji ihe erughị otu pasent merie Democrates na ntuliaka 2016. Ọnụọgụ emere nsonso a na steetti ndị bụ ọgbọọgụ Mgbakọ ""poll"" si steeti ebe a ga-azọ vootu nke ukwuu Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Ebe o si: US Census Mgbe edere akara: 03/11 Mana ọgbụọgụ ebe Trump kacha merie na 2016 bụ ebe ndị otu ya ga-akacha nwee nsogbu ugbua. O ji ihe dịka pasent 8-10 merie na Iowa, Ohio nakwa Texas, mana ugbua ya na Biden ha nhata nha ebe dị a. Ọ ga-abụ ya mere o jiri gbawee onyeisi achụmnta votu ya na Jualị, okwu ọ kpụ n'ọnụ bụrụzịa ""votu adịgboroja"". Ndị ji ya bụ ntuliaka atụ akwụkwọ elefubeghị Trump anya . Otu ụzọ n'ikpo atọ ka na-eche na ọ ga-emerị na ntuliaka a na-abịa n'ụbọchị 3 nke Nọvemba. Ọnwere ka coronavirus siri metuta ọnụọgụ Trump? Coronavirus weere ọnọdụ na ntaakụkọ US kemgbe afọ a ebe ndị kwe ndị ekwe so usoro Trump si ebuso ya agha mere ka nkwado ndị mmadụ gbaa abụọ dịka ka otu pati ha dị. Ọ malitere ịnwe nkwado na Maachị mgbe ọ mere ya bụ ọrịa dịka ihe aga eso n'ọkụ n'ọkụ site na ịnye steeti ọbụla ijeri dọla iri ise ($50bn) ka ha were buso ya agha ma kwụsị nfesa ya. Mgbe ahụ ka ihe suru mmadụ pasent 55 nabatara ọchịchị ya dịka data from Ipsos, ụlọọrụ nchọcha siri dee. Mgbe ahụ ka ndị Pati ya malitere ịkwado ya, enyemaka niile onwetere n'aka ndị Democrats fuo ọhịa. Ọnụọgụ ọhụrụ pụtara na-egosi na ndị nkwado ya amalitela ịrụ ya ụka maka na ya bụ nje coronavirus ebidola ịgbasa na mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọdịda ya nke mba ahụ. Nkwado ndị Republicans ejirila ihe ruru pasent 78 daruo ala kemgbe mbido Julai. Ọ ga-abụ ihe mere na ọ dara mba n'ikpeazụ a, o jiri adọ aka na ntị na ya bụ ọrịa ga-aka njọ tupu ọ dị mma. Ọ ga-abụ ihe mere o jiri yiri mkpuchi ihe nke mbụ nso nso a, ma kpokuo ndị Amerika ka ha malite iyi ya maka nchekwa nakwa irube isi/ Otu ọnụọgụ dị elu ndị ọkachamara na University dị na Washington gbara afa na ndị ga-anwụ na ya bụ ọrịa coronavirus ga-akarị 250,000 mgbe ntulika ga-eru. A ga-atụkwasili ọnụọgụ ndị a obi? Ọ dị nfe ịsị na ọnụọgụ ndị a enweghị isi, maka na ha dara ya na 2016. Mana ọ bụchaghị eziokwu o. Ọ bụ eziokwu na nchọcha ụfọdụ kwuru na Hillary Clinton ji pasent ole maọbụ ole emeri, kemgbe o ji ihe ruru votu nde atọ emeri ogbo ya. Ndị ọrụ Pollsters nwere obere ọgbatauhie na 2016 - Nke mere na ahụghị ebe Trump dị mma n'ụfọdụ ọgbaọgụ ụfọdụ ruo mgbe ya bụ ntuliaka biri. Ụfọdụ n'ime ha akpatụchaala igwa ha aka, mezie ya ugbua. Manaa nke ugbua kazi njọ maka ike ọrịa coronavirus kpara na akụ na ụba nakwa ndị mmadụ nke mere na ọnweghịzị onye ndị mmadụ ga-akwado na ntuliaka Nọvemba. Nke a mere ndi mmadụ ga-eji nwayọ n'itinye ọnụọgụ ndị n'ọrụ, ọkachasị ebe ya bụ ntuliaka ka dịtụ anya. Ka o si aga na ntuliaka Amerịka" 42907260,https://www.bbc.com/igbo/42907260,Legọs steeti emepeela ulọikpe ọhụrụ maka ndị awakporo,"Titilola Vivour-Adeniyi bụ onyeisi na-ahụ maka ndị awakporo na ndị a na-emesiike (Domestic and Sexual Violence Response Team, DSVRT) na Legọs steeti, gwara BBC na ọ bụ eziokwu na-ekewapụtala ụlọikpe ga na-elekọta ndị nwere udịrị mmetụta a.","Mpụ nwakpo na-eweta nnukwu mwute na Naijiria Onyeisi ọkaikpe ndị Legọs steeti bụ Opeyemi Oke mepere ụlọikpe abụọ ndị a n'Ikeja, taa bụ ụbọchị nke mbụ Febụwarị. Emepekwara ụlọikpe ndị ọzọ ga-ahụ maka mpụ ndị ọzọ a na-eme na Legọs. Onyeisi ọkaikpe bụ Zainab Bulkachukwa, Justice MI Garba, nwunye gọvanọ Legọs bụ Dolapo Ambode, osote gọvanọ Legọs bụ Idiat Adebule, na nwunye osote onyeisiala Naịjirịa bụ Dolapo Osinbajo, so na ndị ukwu bịara mmepe ụlọikpe a. Kedụ ndị ihe a metụtara? Vivour-Adeniyi kwuru sị na onye ọbụla na-awakpo mmadụ na onye ọbụla na-emesi onye ya na ya bi ike (domestic violence) na-achọ gọọmentị okwu. Nke a kpatara na anwụchie gị ka ịkpara ọdịrị agwa a, gọọmentị ga-eji aka ha ekpe gị ikpe." afirika-51641157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51641157,Imo State: 'O nweghi onye Gọvanọ Uzodinma nyere ọkwa 'Emir',Akụkọ na'efegharị na soshal midia na-ekwu na Gọvanọ Hope Uzodịnma nke Imo steeti ahọpụtala onye ga-abụ 'Emir' na steeti ahụ bụ akụkọ ụgha.,"Content is not available End of Facebook post, 1 Nnyocha BBC Igbo mere gosiri na onweghi onye ọbụla bụ 'Emir' na Imo steeti. Ihe mere bụ na ndị Igbo na-ekpe okpukperechi Alakụba gara njem nleta na ekele n'ụlọ gọọmentị Imo n'ụbọchị Tuzde. Ha gara ka ha gosi Gọvanọ Uzodinma onye ha họpụtara dịka onyeisi ekpere ha nke a kpọrọ Imam. Dịka Ihe onyonyo BBC Igbo hụrụ si gosi, aha Imam a bụ Suleiman Njoku. Ọ bụ onye Mbaise, ma bụrụkwa onye ọkaiwu. Onyeisi otu a kpọrọ 'Imo State Muslim Council' bụ Basheer Uwakwe, sokwa mee njem a. Uwakwe kọwara na ha họọrọ Njokụ dịka 'Imam' n'ihi ọnwụ Alhaji Dauda Onyeagaocha, bụ onye jibu ọkwa ahụ tupu ọ laa mmụọ. Ọ bụghị Uzodinma ji aka ya họpụta 'Imam' ahụ dịka akụkọ ụfọdụ si ekwu. BBC Igbo kpọtụkwaara Oguwike Nwachukwu bụ onyeisi mgbasa ozi Uzodinma, mana ekwentị ya agaghị aga. Mana Marcel Nlemigbo, onyeisi pati APC n'Imo steeti kwuru na onweghị ihe ọbụla dịka ọkwa 'Emir' na steeti ahụ. 'Supreme Court' enyela APC ọsọ ọzọ Duoye Diri (yi akwa anụnụ anụnụ) bụ Gọvanọ Bayelsa steeti Ụlọikpe kachasị enyela ndị otu pati 'All Progressives Congress' ọsọ gbasara ikpe onye meriri ọkwa gọvanọ Bayelsa steeti. Na mkpebi e nyere n'Abụja n'ụbọchị Wenezde, ụlọikpe kwuru na ndị APC ejighi okwu. Cheta na ndị ọkaikpe ise nke ụlọikpe kachasị kagburu mmeri David Lyon nke APC na ntuliaka gọvanọ Bayelsa e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2019, ma kwuo na ọbụ pati 'Peoples Democratic Party' meriri. Ha kọwara na Biobarakuma Degi-Eremienyo bụ onye so Lyon zọọ ọchịchị dịka osote gọvanọ nyere ụlọọrụ INEC asambodo adigboroja. N'ihi nke a, ha kagburu vootu niile nke APC (Lyon na Degi-Eremienyo) nwetara na ntuliaka ahụ. Mana ndị APC gbara isi akwara ma gaghachi azụ n'ụlọikpe rịọ ha ka e lebaa anya n'ikpe ahụ ọzọ. Ụlọikpe kachasị wee gbakwaa isi akwara kụchapụ ya bụ ikpe. Ndị ọkaikpe ahụ dakwara ndị ọkaikpe ndị APC nakwa ọkaikpe David Lyon nha nde naịra iri n'otu n'otu maka ịmetọ usoro iwu. Na nkwubi okwu ha, ndị ụlọikpe kachasị kwuru na ha abụghị nkịta na-agbụpụ racharakwa. Ndị ụka Katọlik emeela ngagharị ekpere n'Enugwu Ndị ụka Katọlik n'Enugwu amalitela ngagharị ekpere iji ruo ụjụ maka ndị otu Kraịst e gburu egbu na Naịjirịa. Cheta na ndị Bishọp Naịjirịa nyere ntuziaka ka ndị ụka ha niile yie uwe ojii n'ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị ụka ntụ maka mmalite oge Lent. Nke a bụ iji ruo ụjụ maka ndị niile ndi ekperima gburu n'ọdị nso a. Amalitela akwamozu Hosni Mubarak Ọ bụ ndị agha bu akpati ozu Mubarak. Mba Egypt amalitela emume akwamozu maka aka chiburu mba ahụ bụ Hosni Mubarak. Gọọmentị Egypt na-akwanyere Mubarak ugwu pụrụ iche na-agbanyeghi na ụlọikpe mara ya ikpe maka nrụrụaka oge ọ dị ndụ. Onyeisiala mba ahụ bụ Abdul Fattah al-Sisi na ndị ọzọ welitere isi gara ya bụ emume, ebe ọbụkwa ndị agha bu akpati ozu Mubarak. Gọọmentị wepụtakwara abalị atọ iji ruo ụjụ maka ọnwụ ya. Mubarak nwụrụ n'ụbọchị Tuzde ka ọ gbachara afọ iri itoolu na otu. A taala ndị Abia Warriors ahụhụ Ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa eriela otu egwu bọọlụ Abịa Warriors iwu nde naịra ise maka iluso ndị Enyimba ọgụ oge ha abụọ sọkọtara mpi n'izuụka gara aga. N'ime ego a, a ga-enye ndị Enyimba nde naịra abụọ na ụma ise. Abia Warriors ga-agbakwa asọmpi atọ ha na-abịa abịa n'ama egwuregwu a kpọchiri akpọchi na-enweghi ndị otu ha ga abịa ịja ha ike. Oge ọgụ ahụ dapụtara n'etiti ndị nkwado otu egwu abụọ a, e merụrụ onyeisi ndị Enyimba bụ Felix Anyansi-Agwu ahụ nke mere ka e buru ya gaa ụlọọgwụ. Coronavirus abaala mba Ọljirịa Ndị uweojii kpuchiri imi na mba Ọstrịa Ọrịa coronavirus abatala na mba ndị nọ na Yurop gụnyere Ọstrịa, Kroeshia na Swizaland, nakwa n'Ọljiria dị n'Afrịka, dịka ndị si mba Itali lọta butere ya. Ka ọ dị ugbua, Itali so na mba ndị ọrịa a kacha enye nsogbu dịka o gburula mmadụ iri na otu n'ime ihe karịrị narị atọ bu ya. Iwu ọhụrụ nwereike ikpuchite ndị omeiwu Ndị ụlọomeiwu nta ebufeela iwu nke ga-ekpuchite ndị omeiwu etiti nakwa nke steeti n'aka onye ọbụla chọrọ ịgba ha akwụkwọ n'ụlọikpe. Nke a bụ ugboro abụọ a ga-ebufe iwu a bụ nke Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ụlọomeiwu ahụ sị na ya akwadoghi. Ọ sị na naanị ihe ga-eme ka ọ kwado ya bụ ma ọ bụrụ na iwu a ga-ebido n'afọ 2023, bụ mgbe ha ga-aritu n'oche ọchịchị. A gbasaala ngalaba ZIS Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị Uweojii Naịjiria agbasaala ngalaba Zonal Intervention Squad (ZIS) iri na abụọ, n'ihi ogbugbu Kazeem Tiamiyu bụ ọgbaa bọọlụ ndị ngalaba ahụ kwapụrụ n'ụgbọala na-aga aga. Ndị ngalaba ahụ nọ na-arụbu n'okpuru osote onyeisi ndị uweojii n'obodo ndị bụ okeala na Legọs na Ogun steeti. Ọgbaaghara ataala isi mmadụ 21 n'India A gbaala ihe ruru ụlọalakụba abụọ ọkụ kemgbe ọgbaaghara a dapụtara Ọnụọgụgụ ihe nwụrụla n'ime abalị atọ ọgbaghara dapụtara n'obodo Delhi dị n'India, eruola iri abụọ na otu. Mara na ọgbaghara a mere e jizi na-awakpo ndị ụka alakụba, dapụtara n'ihi okwu gbasara iwu amaala. N'egwuregwu, Otu onye ga-anụ ụda ya taa mgbe Real Madrid na Man City ga-ezute na Santiago Bernabéu. Ebe Cristiano Ronaldo na ndị Juventus ibe ya ga-eburu ọgụ gakwuru ndị Lyon na Frans. Ụbọchị ụka ntụ Taa bụ ụbọchị Wenesde ka ndị ụka Kraist nọ na mpaghara dị iche iche n'ụwa ga-anara akara ntụ. Mana ndị Bishop nọ n'okpuru Catholic Bishops' Conference of Nigeria (CBCN) ekwuola na ha ga-eme ekpere ngagharị n'ụbọchị ụka na-abịanụ iji gosi iwe ha gbasara enweghị ezigbo nchekwa na Naịjiria. Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins Ihe gbasara nchekwa Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Ndị ụlọomeiwu ukwu agwala ọchịagha ndịagha Naịjirịa ka ha mepegharịa isi ụlọorụ ha n'obodo Garkida dị n'Adamawa steeti nakwa nnukwu obodo ndị dị nso oke ọhịa Sambisa. Nke a na-abịa dịka ndị omekome wakporo obodo Garkida n'abalị ise gara aga. N'egwuregwu, Ndị Chelsea ji nkata kporo goolu atọ asataghị otu dịka Bayern Munich bịara n'azụ ụlọ ha gbabaa ha afọ n'asọmpi Champions League. Barcelona na onwe ha zọrọla isi onwe ha n'aka Napoli dịka ha sara otu goolu e nyere ha iji gbaa onye lawa onye lawa. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins" afirika-45545502,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45545502,South Afrịka: Nṅụwa nụ anwụrụike - Ụlọikpe,Akụkọ kachasị mkpa taa:,"Ṅụwa nụ anwụrụ ike - Ụlọikpe Saụt Afrịka Ụlọikpe kachasị na mba Saụt Afrịka e nyela ndị tozuruoke ikike ka ha sewe anwụrụ ike na atụghị ụjọ ọbụla. Mana gọọmenti mba Saụt Afrịka gbarụrụ ihu na ya bụ ikpe kwuo na anwụrụike a na-emerụ mmadụ ahụ. Amnesty International akatọọla ọnwụ Nọọsụ Ụlọọrụ Amnesty International akatọọla ogbugbu ndị Boko Haram gburu onye Nọọsụ ndị Red Cross ha tọọrọ kamgbe ọnwa Maachị afọ 2018. Diraktọ ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Osai Ojigho gwara gọọmenti ka ha gbaa mbọ zọpụta ndị ọrụ ahụike nakwa Leah Sheribu bụ ndị eji eji. Ụlọikpe sị ka anwụchie Sịnetọ Uzodimma Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Ụlọikpe dị n'Abuja e nyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie Sinetọ na-anọchi anya Imo West bụ Uzodinma Okpara. Ụlọikpe a kwuru na ọ jụrụ ị bịa zara ọnụ ya maka ebubo inye akwụkwọ e ji a dọrọ ego bụ adịgboroja dị nde narị naịra abụọ. N'egwuregwu Abalị a ga-abụ oke ọṅụ nye ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya dịka asọmpi Uefa Champịọn ga-amalite ọzọ. Otu Intermilan ga-alọghchite n'asọmpị a ọzọ kamgbe afọ isii gara aga ha gbasọrọ ya. Nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Isi kote ebu ọ gbaa ya Ụlọomeiwu atụọla mmadụ abụọ bụ ndị otu Chukwudumeme Onwuamadike a ma dịka Evans, nga mkpụrụọka. Chukwudumeme Onwuamadike a ma dịka Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa Ọkaiwu Oluwatoyin Taiwo tụrụ Kelvin Emenike Ukoh na Emeka Obasi nga afọ iri anọ na otu maka mpụ a. Cheta na ụbọchị ole na ole gara aga, Evans gọrọla ụkwụ na aka ya sị na ọ bụghị onye ntọ. Ntorobia akatọọla Buhari Ndị ntorobia Ohaneze Ndigbo akatọọla Onyeisiala Muhammadu Buhari maka nhọpụta a họpụtara Yusuf Bichi dịka onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS. Kingsley Dozie bụ onye ndu otu a depụtara akwụkwọ ozi kwuru na Buhari mere nhọpụta a site n'ịkpa oke agbụrụ. Na mba ofesi, Mba Amerịka ekwuola na ha ga-ebutu ọnụọgụgụ ndị mbịarambịara na-abata n'obodo ha ruo puku iri atọ n'afọ 2019. Cheta na ọnụọgụgụ nke afọ 2017 bụ puku iri ise ebe nke 2018 bụ puku iri anọ na ise. N'egwuregwu, Nwaafọ Nigeria bụ Leon Balogun, esoghi gbaa bọọlụ ka ndị otu ya bụ Brighton na Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbaa onye laba onye laba. Gụọ nkeji taa: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" media-53370509,https://www.bbc.com/igbo/media-53370509,World Population Day: Onye ka ọ dị n'aka ikwu ụmụ ole a ga-amụ n'ezinaụlọ?,Ndọrịtaụka na-apụtakarị okwu n'etiti di na nwunye bụ nwa ole ha ga-amụ nakwa afọ ole kwesịrị idị n'etiti nwoke na nwaanyị.,"Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na ndị okwu gbasara ezinaụlọ nwere, ha kwuru na ya bụ okwu bụ ụka ọ ga abụ di na nwunye kpaa, ha ewere isi ha kwee ya. Comfort Obi bụ'Programm Officer' n'ụlọọrụ 'Planned Parenthood Federation of Nigeria (PPFN), ngalaba nke Abia Steeti na Chidi Lemchi, onye nna ma bụrụ onye ọrụ nchọcpụta doro anya bụ ndị tụnyere ọnụ n'okwu ahụ. Lee ọkpụrụkpụ okwu ndị ọzọ ha kwuru : Kirie mkparịtaụka ahụ n'uju n'ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45477512,https://www.bbc.com/igbo/45477512,Ndị na-anya ụgbọala na-ebu mmanụ ajụla ibu mmanụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Buhari ga-azọ na ntuliaka imeụlọ APC 2019 na ha ebiri ọkụ o! Onyeisiala Muhammadu Buhari anatala akwụkwọ igosi ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'okpuru pati APC. Otu kporo onwe ha National Consolidation Ambassadors Network (NCAN) bụ ndị gbatara ya akwụkwọ ahụ ma wegara ya n'ụlọ ya n'Abuja taa. Ụkọ mmadụ nwereike ibido Mpitimpi ga-ekwe ma ọbụrụ na onweghi ihe e mere gbasara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na-achọ ịgba abụbọ ọrụ. Akụkọ apụtala na mmanụ ụgbọala nwereike ịkọ maka na otu ndị na-anya ụgbọ na-ebu mmanụ ahụ n'ime otu Nupeng ajụla iburu mmanụ n'ọdọ mmanụ dị icheiche na Legos. Kofi Annan alọrutela Gana Ụmụ Gana na-akwụ n'ahịrị kamgbe ụtụtụ ileta ozu dike ukwu ha lara mmụọ bụ Kofi Annan. Kofi Annan, bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị 'United Nations' Annan bụbu onyeisi otu UN nwụrụ n'ọnwa Ọgọstụ na mba Swizalnd mana e bulatara ozu ya na mba ya bụ Gana taa. A daala Marcelo Real Madrid nha Amaala onye na-agbara Real Madrid bọọlụ bụ Marcelo ikpe ịga mkpọrọ ọnwa anọ na ịkwụ ego dị puku narị Yuro asa na iri ise maka akwụghị ụtụisi na mba Spen. Marcelo ekwetela ịkwụ ya bụ ego mana ka e wepụrụ ya ntaramahụhụ ịga mkpọrọ. Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị ụka katọlik sị na agaghị akwụ ndị ntọ ụgwọ Nke abụghị mbụ a na-atọ ndị ụka fata na Naịjirịa Ụlọụka ndị fada bụ nke katọlik akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị akwụ mkpa n'aka maka ndị ntọ ịhapụ Rev. Christopher Ogaga bụ onye a nwụchiri na Delta Steeti. Most Rev. Paulinus Ezeokafor bụ onye kwuru nke a n'Ọka ụnyaahụ gwara ndị ntọ ahụ ha wepụ akpịrị ha n'ego nde naịra iri na ise (15) ha na-ana ụka. Orji Uzo Kalu agaghị ụlọikpe ụnyaahụ Na nsonso a, EFCC kpofuru ebubo na Orji Uzo Kalu mefuru nde kwuru nde naira oge ọ chịrị Abia dịka Govanọ na pati PDP N'aka ọzọ, ụlọikpe ukwu dị na Legọs abaarala Orji Uzo Kalu oke mba maka ịgbahapụ oku a kpọrọ ya ụnyaahụ. Orji Uzo Kalu kwesịrị ịbịa zara ọnụ ya n'ebubo ihe karịrị ijeri naịra asaa (7) na ụma a na-ebo ya. Ọkaikpe ukwu ya bụ okwụ dị n'aka bụ Justice Mohammed Idris sị na Orji Kalu gbara agwa ka ofogori. ICC sị na ha ga-ekpe US Ikpe US esoghi n'otu ICC N'ofesi, mba US eforola ntutu taa na ha ga-amapụ ụlọikpe ukwu na-ahụ maka mpụ na mbaụwa ma ọ bụrụ na ha nwaa anwaa kpee ndị agha US ikpe. John Bolton bụ odeakwụkwọ maka nchekwa obodo mba US kwuru nke a n'ịsa okwu ya bụ ụlọikpe maka echiche ha, ikpe ndị ọbụla dara iwu e ji alụ agha nke mbaụwa n'Afganịstan, ọbụnadị US. N'egwuregwu, Henry Kane nke England enyela golu 14 n'ime ugboro 14 ọ gbagoro bọlụ N'egwuregwu, Ingland na Swizaland ga-asọmpi enyi na enyi tata ma ọ kụọ elekere asatọ nke abalị Septemba 11 nke 2018, na King Power stadium nke dị n'Ingland. Henry kane agaghị eso sọọ ya bụ mpi. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Ndị ọchịchị ejighị ntị anụ aha Charles ogbu. Ha na ahụta Ogbu ka nwanza rijuru afọ bịara chi ya mgba. Ya kpatara femi Adesin jiri sị na ya agaghị asa ya okwu. Charles Ogbu sị na Onyeisiala bụ odibo ndị Naịjirịa" 44546998,https://www.bbc.com/igbo/44546998,OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule,"Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọkachasị ụmụnwaanyị etoola Obafemi Awolowo University,(OAU) Ile-Ife dị n'Ọsun steeti maka ụgbọ nwamkpi ha gbara onye nkuzi ha bụ Prof Richard Akindele maka ebubo ịchọ idina nwaakwụkwọ ya iji nyere ya aka igafee ule.","OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule Mkparịtaụka ha na onye ntakụkọ BBC nwere, ha kwuru na ntarahahụghụ ahụ enyere onye ahụ ga-akuziri ndị ọzọ ihe. N'okwu ya Esther Okoro, onye bụ nwakwụkwọ na University of Port-Harcourt kwuru, ""O bụ ihe dị mma."" Okoro kwuru na 'Ana m anụ ya na akụkọ. Ụdị ihe a emebeghị. O nwebeghị onye mma o mere."" Ụfọdụ kwuru ka ndị isi mmahadum tinyere ndị nkuzi ọzọ anya iji kwụsị mpụ a. OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Cheta na ụbọchị Wenesde, onyeisi mahadum OAU bụ Eyitope Ogunbodede kwupụtara na mahadum ahụ achụọla onye nkụzi ha bụ Prof Richard Akindele maka ịrịọ nwaakwụkwọ ya ndina iji mee ka ọ gafee n'ule. Ogunbodede kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, kwuru na bọdụ mahadum ahụ mara Akindele ikpe n'ebubo niile e boro ya. Ọ gara n'ihu kwuo na mahadum ahụ ewepụtala atụmatụ ịhụ na ekpochapụrụ nsogbụ ndịna maka ịgafe ule kpamkpam. OAU bụ ụlọakwukwọ mahadum na-ewu ewu maka ezi mmuta OAU tinyere ọnụ n'okwu ahụ ka otu nwaakwụkwọ ha zipụchara ozi dị n'igwe e ji amịta okwu (recorded audio) na soshal midia nke gosipụtara olu Akindele ka ọ na-amanye ya ka ya na ya dina iji gafee ya ule. Mahadum ahụ họpụtara kọmitii ga-etinye anya n'okwu ahụ ma kwe nkwa inye ọnye ọbụla ikpe mara ntaramahụhụ. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-eto mahadum ahụ n'igwe Twitter maka ịchụ onyenkuzi ha maka ihe o mere. Onye kpọrọ onwe ya Bionerd, kwuru na nke a ga-akụziri ndị ọzọ ihe. Dr Dipo Awojide kwuru na nke a gosiri ọganihu." afirika-51102876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51102876,Amotekun: Gọọmenti etiti chọrọ ka e wugharịa nhazi Amotekun,Gọọmenti etiti na ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ ekwekọrịtala n'okwu banyere Amotekun n'ọgbakọ ha nwere n'obi gọọmenti n'Abuja ụbọchị Tọọzde.,"Ụgbọala ndị nche Amotekun Ndị nọ n'ọgbakọ ahụ nke Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo no n'isi ya gụnyere onyeisi ndị uweojii nakwa Ọkaiwu Ukwu Naijiria na ndị gọvanọ Ọdida-Anyanwụ. Okwu banyere Amotekun kpowanyere ọkụ na Naijiria dịka ndị nwere agba n'ala Yoroba na Ugwu-Awusa na-adụ onwe ha aka n'ọnụ banyere otu nche ahụ Yoroba hiwere na nsonso maka nsogbu ntọ na iji egbe ezu. Mana gọọmenti ekwuola na ha ekpeziela ya bụ okwu. Dịka ozi ụlọọrụ onyeisiala wepụtara n'akara Twitter ha kwuru na ha kwekọrịtara na a ga-ahazigharị Amotekun ka ọ gbaso atụmatụ nche ọha obodo nke bekee kpọrọ 'Community policing.' Ha kwekọrịtakwara na steeti niile o metụtara mee iwu ga-akwado atụmatụ Amotekun. Cheta na ụbọchị Wenezde, Tinubu tinyere ọnụ n'okwu ahụ were kpọọ oku ka a kpaa ya akpaa. Tinubu etinyela ọnụ na ndọrịtaụka gbasara Amotekun Onye ndu otu APC bụ Ahmed Tinubu etinyela ọnụ ndọrịtaụka na-akpọtụ n'etiti ndị Ugwu na ndị Yoroba gbasara otu nche a kpọrọ 'Amotekun' nke ndị gọvanọ Ọdịda-Anyanwụ hibere na nsonso a. 'Amotekun' bụ otu nche nke gọọmenti steeti isii dị n' Ọdịda- Anyanwụ hiwere maka ibu agha megide ntọ, iji egbe ezu na arụrụala ndị ọzọ. Tinubu kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke o binyere aka na ya n'ụbọchị Wenezde. O kwuru na ma ndị na-akwado ya bụ atụmatụ, ma ndị na-ekwugide ya, ha aghọtaghị ihe otu ahụ bụ. Ọ sịrị: ""Ị jụọ ndị na-akwado Amotekun, ọtụtụ n'ime ha amaghị nke a na-akọ banyere ya karịa ị na-ebo ndị na-akatọ ya ibu ajọ ihe n'obi."" ""Ị jụkwaanụ ndị na-akatọ ya, ha amaghị ihe ọbụla banyere atụmatụ ahụ."" ""Ha na-akatọ ya n'ihi na ọ bụ atụmatụ nke ndị ha na ha anọghị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ nke enweghị uru ha ga-eritenwụ na ya."" ""Etu ndị mmadụ si adọrịta ụka maka ya bụ atụmatụ na-egosi na ọchịchị onye kwuo uche ya akwụsibeghị ike."" Ọ gara n'ihu kpooo oku ka a kpa ya bụ okwu akpa. Cheta na kemgbe e hiwere Amotekun, ọtụtụ otu na ndị nwere agba na mpaghara Ugwu akatọọla ya. Otu Miyetti Allah sị na ọ bụ ụzọ ndị Yoroba ji chọọ ikewapụ na Naijiria . Ha gara n'ihu gwa ndị Yoroba ka ha chefuo ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 ma ha jụ ikposa otu nche ahụ. N'aka nke ọzọ, ọkaikpe Naijiria bụ Abubakar Malami kwuru na ya bụ atụmatụ megidere iwu Naijiria. Amotekun: Gọọmenti etiti esepụla ndị ndịda-anyanwụ ara n'ọnụ Ụgbọala ndị nche Amotekun Gọọmenti etiti akagbuola atụmatụ otu nchekwa nke steeti dị na Nda-Anyanwụ Naijiria jịkọro aka wube. Gọọmenti steeti isii nọ na Ndịda-Anyanwụ Naijiria(Oyo,Ogun,Osun,Ondo,Ekiti na Legọs) jịkọtara hiwe otu nchekwa obodo maka ibelata nsogbu iji egbe ezu ,ntọ na mkpamkpa ndị ọzọ nke ha kpọrọ 'Amotekun."". Mana n'ozi nke onye nnyemaka mgbasaozi nke ụlọọrụ Abubakar Malami bụ Ọkaikpe Naijiria a kpọrọ Umar Jibrilu Gwandu binyere aka Ọ sịrị na , ""Nhibe e hibere otu nche a kpọrọ Amotekun megidere iwu, o megidere iwu Ala Naijiria."" Gọọmenti etiti gbadoro ụkwụ na nke a were sị na o nweghị onye nwere ike ihiwe na steeti. ""O nweghị steet maọbụ mpaghara nwere ikike ihibe otu maka ichekwa Naijiria maọbụ akụkụ ọlụla n'ime ya."" Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Yoroba gụnyere Wole Soyinka nakwa Femi Falana akatọọla ya bụ okwu Malabi kwuru. Cheta na ụfọdụ ndị Ugwu ọnụ na-eru n'okwu katọrọ atụmatụ 'Amotekun.' Otu Miyetti Allah site n'ọnụ odeakwụkwọ ha bụ Alhassan Saleh kwuru nkata ha na ụlọakụkọ Punch nwere na ya bụ mkpookọba otu nche nwereike ime ka ohere iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 gbalahụ ndị Yoroba. Tanka mmanụ agbịdị agbaala ọkụ ma gbuo otu nwoke Tanka mmanụ agbịdị agbaala ọkụ ma gbuo otu nwoke na bypass AmawbiaTanka bu mmadụ agbịdị agbaala ọkụ na Bypass Amawbia nke dị nso n'okporoụzọ Enugu na Anambara. Ndị uweojii kwuru nas ọkụ ahụ na-agbasi ike ma dọ ha aka na ntị maka ịbịa nso n'ebe ahụ. Ha kwuru na ha agbachiela gburugburu ebe ahụ ma kpọọ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ka ha bịa rụọ ọrụ. Nyocha gosiri na ya bụ tanka biara ka arụọ ya ọrụ dịka ọ wụpụchara mmanụ ụgbọala. O bụ onye 'Welder' aha ya bụ Ayo Adenipekun eji 'AY' mara chọrọ igba ya bụ ụgbọala ọkụ ka ọku a gbagburu. Ebe otu nwoke na aruzi ụgbọala na otu nwaanyị bụ ndị ọzo ebu gawa ụloọgwu maka ya bụ ọkụ. Ụgbọala anọ, Tanka abụo, otu 'tipper' na ụgbọala 'Toyota Camry. Akụkọ si ebe ahụ ka na-abịa. Ihe ndị dị mkpa maka 'Finance Bill' Buhari binyere aka na ya Onyeisiala Muhammadu Buharị na onyeisi ndịọrụ ya bụ Abba Kyari Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyerela aka n'akwụkwọ iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Finance Bill' ọtụtụ ụmụ Naịjitịa na-ajụ ihe ya bụ iwu pụtara. Iwu 'Finance Bill' gbadoro ụkwụ n'ụzọ gọọmentị etiti nwere ike isi wulie akụnụba ya site n'ịnakọ ụtụisi. Nke a pụtara n'ịnakọ ụtụisi na Naịjirịa apụọla n'egwu a chị ụtaba n'aka agba. Lee ihe ndị dị mkpa gbasara iwu 'Finance Bill': Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu ọhụrụ a Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi @yojora kwuru na iwu a mara mma nke ukwuu maka ụlọọrụ nta na-amalite amalite: @Miss_Bilala jụrụ ndị mmadụ ma ha enwetakwala akara TIN ha: Ị ma etu azụ okporoko si bata na Naịjirịa? Ebe a na-ere okporoko n'ahịa Oyingbo dị na Legọs Otu ihe ọma e nwere ike ikwu na agha Biafra wetara na Naịjirịa bụ azụ okporoko. Ọ bụ mgbe mba Norway gbataara ndị Biafra ọsọ enyemaka n'oge agha ka ha bubatara okporoko iji nyere ndị agụụ na-egbu aka. Akụkọ a dị n'uju ebe a. Atụmatụ nchekwa 'Amotekun' bụ n'Ebonyi ka o si Gọọmentị Ebonyi steeti na-akọwa na ọbụ na steeti ahụ ka ndị gọvanọ mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa si nyopute atụmatụ nchekwa ọhụrụ ha hibere bụ nke a kpọrọ 'Amotekun'. Onye kwuru nke a bụ Cọmisọna na-ahụ maka nchekwa na Ebọnyị bụ Stanley Emegha. Ọ kọwara na atụmatụ ahụ adịla ire kamgbe n'Ebonyị nke mere na ụmụ kịrịkịrị mpụ dịka ọhị, ntọ na ndị ọzọ adịghịzị na steeti ahụ. Emegha kwuru sị: ""Oteela anyị malitere ụdị atụmatụ a n'Ebonyi."" ""Onye chepụtara ya bụ ọchịagha a ma ama larala ezumike nka aha ya bụ Obi Umahị."" ""Anyị achọghị ime mkpọtụ maka ya ka ndị omekome ghara ịma ka anyị si kwado chebiri ha."" Iran Iran kwuru na ọbụ amaghị ama ka ndịagha mba ahụ ji gbatuo ụgbọelu Anwụchiela ọtụtụ ndịagha na mba Iran maka ịgbatu ụgboelu ụgbọelu mba Yukren ma gbuo otu narị mmadụ na iri asaa na isii n'abalị asatọ nke ọnwa Janụwarị a. Ndi isi Yukren kwuru na nke a bụ iji gosi njikere ha ịhụ na ikpe nkwụmọtọ weere ọnọdụ gbasara ya bụ ọdachi. Ibuso ndị oyi egwu agha n'Afrịka Onyeagha Fransị na-arụ ọrụ na Bọkịna Faso Mba Fransị na mba ndị si na mpaghara 'Sahel' nke Afrịka ekwekọrịtala ibusi agha ike megide ndị oyi egwu. Nkwekọrịta bụ n'ọgbakọ e nwere na Pau dị na Fransị. Ndị isiala Niger, Mali, Burkina Faso, Chad na Mauritania sọnyere na ya bụ ọgbakọ. Onyeisiala Fransị bụ Emmanuel Macron nọrọ n'ọgbakọ ahụ kwe nkwa iziga ndị agha 220 ọzọ tinyere ndịagha 4,500 bụ ndị nọ ugbua n'Afrịka. Ọgụ Fury na Wilder Deontay Wider na Tyson Fury Oti ọkpọ bụ Tyson Fury etuola ọnụ na ya ga-akụpụ Deontay Wilder naanị n'agba nke abụọ mgbe ha ga-ezute onwe ha n'oge adịghị anya. Ogụ a ga-abụ na abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị ka ọ ga-akpọtụ. Barcelona enyela Valverde ọsọ Ernesto Velvarde Otu egwuregwu bọọlụ nke mba Spen bụ Barcelona enyela onye nkuzi ha bụ Ernesto Valverde ọsọ. N'egbughị oge ọbụla, ha họọrọ nwa amadị aha ya bụ Quique Setian ka ọ nọchie anya ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra" afirika-44848675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44848675,Ihe ọma e merela ụmụ Naịjirịa tọrọ na Rọshịa,Onye ọgbasa ozi onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu denyere n'akara ya na Twitter na Buhari agwala Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ka ọ hazie etu a ga-eji kpọlata ụmụ Naịjirịa tọọrọ na Rọshịa.,"Ndị tọọrọ na Rọshịa ruru mmadụ 200 Ndị a tọọrọ so na ndị gara ikiri iko mbaụwa, mana ọtụtụ n'ime ha tọọrọ mgbe ha ruru ebe ahu chọpụta na ndị aghụghọ aghọgburu ha. N'ozi a o dere, Shehu sị na onyeisiala sị ka eme ihe niile a ga-eme n'ịhụ na ndị a lọtara. End of Twitter post, 1 Ọ gakwara n'ihu kwuo na Onyeama amalitela ọrụ n'ịhụ na ihe gara etu onyeisiala siri kwuo. Ma kwukwa na ihe a na-eme bụ site na-etu onyeisiala jiri chọ ịhụ na ndị Naịjirịa nwetara nchekwa ebe ọbụla ha nọ n'ụwa. Cheta na BBC dere maka ndị tọọrọ na Rọshịa n'ụbọchị Satọde. Gọvanọ na-achị Legọs bụ Akinwumi Ambode kwụru ụgwo ka mmadụ 50 tọọrọ na Rọshịa lọta. Yulia Siluyanova, bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndi a na-emegide na Rọshia, gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ, ma kwukwa na ha ga-ahụ na ndị a tọọro ga na-eri nri ruo mgbe ha malitere njem ịlaghachị Naịjirịa." afirika-48829420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48829420,Patience Jonathan: Ụlọikpe anakọrọla nwunye onyye bụbụ onyeisiala ego EFCC sị na o zupuru,Ụlọikpe ukwu dị na Steeti Legọs enyela iwu ka gọọmentị Naijiria weghara ego dị nde dollar asatọ na ụma nakwa ijeri naira itoolu na ụma bụ nke a sị na Patience Jonathan zupuru oge di ya bụ Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.,"Patience Jonathan bụ nwunye onye chibụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan Ọkaikpe Mojisola Olaterogun nyere iwu a n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jụlaị bụ Monde wee kwuo na Patience enyeghi nkọwa zuru oke etu o si nweta ego ndị ahụ. Cheta na ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' gbara Patience Jonathan akwụkwọ n'ihi ebubo nrụrụaka. Ndị EFCC kwuru na Patience zupuru ego buru nnukwu ibu oge di ya bụ onyeisiala ma were ego ndị ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ nakwa ala. Ha rịọrọ ọkaikpe ka o nye iwu ka eweghachiri gọọmentị ego, ụlọ na ala ndị ahụ Patience ji ego o zupuru wee zụọ. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-49111267,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49111267,Shia Protest: 'Gọọmentị Buhari na ndị Shia na-akpa nkata',"Dịka a ka na-ekwu maka ịkwa isi dị n'etiti ndị ofufe Shia bụ ndị akpọrọ Islamic Movement of Nigeria (IMN) na ndị nchekwa Naịjirịa, akụkọ na-apụta na ha na gọọmentị Naịjirịa kpara nkata maka etu a ga-eji tinye mma n'ọbọ.","Ndị Shia na-eme ngagharị iwe kwa ụbọchị ka atọghapụ onyeisi ha bụ Ibrahim el-Zakzaky gọọmenti ji kemgbe afọ 2015. Ọkụekwe otu a bu Ibrahim Musa gwara BBC na ndi otu ha na ndị DSS - bụ ngalaba ọrụ nchekwa Naịjirịa - mere nzukọ ịkpa maka ọgbagahra na-ada n'etiti ha mana okwu ha achịtaghị aja. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya enweghi ike ikwu ihe mere okwu ha jiri gaa etu o si gaa. Agbanyeghị nke a, BBC enweteghi akaebe nke ha na nzukọ a mere. Ụfọdụ otu na-agba mbọ maka ikike dịri onye na-ekwu na ekwesịrị ime nchọpụta etu esiri gbuo mmadụ maọbụ mekpaa mmadu ahụ n'ọgbaghara ahụ. Ha sị na ndị uweojii ji aka ike sowe ndị Shia mana ha na-agọ ụkwụ na aka. Ụlọ ọrụ ndị ọrụ gbata gbata NEMA a gbara ọkụ n'ọgbaghara ndị Shia Mmadụ 13 nwụrụ n'ọgbaghara a - Ndị Shia 11, otu onye uweojii nakwa otu onye ntaakụkọ sị Channels TV . Gọọmentị na-ekwu okwu ịmachị ndị ofufe Shia mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na nke a abụghị ụzọ a ga-eji wụọ mmiri oyi n'ihe mere. Ọgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja" afirika-43940124,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43940124,Akụkọ kachasi n'abalị a: Ngagharịiwe CAN ga-aga n'ihu na Naijiria niile,Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụtụtụ a:,"Dịka otu jịkọrọ ndị otu Kraist a kpọrọ CAN n'aha ịchafụ na-ekwusi ike njikere ha dị ime ngagharịiwe na Naijiria niile maka oke ogbugbu mmadụ ndị ọchịehi meere na Benue steeti, ndị omekome buu egbe wakporo obodo Birnin Gwarị na Kaduna steeti ụnyaahụ ma gbuo ihe karịrị mmadụ 10, merụọ ịrị atọ ahụ,tọrọ ụfọdụ mmadụ ma gbakwa ọtụtụ ụlọ ọkụ. End of Twitter post, 1 Na mba ofesi Mba Nọt Koria ekwela nkwa na ha ga-emechi ụlọọrụ ebe ha na-enyocha usoro ngwa agha nuklia. Kim Jong Un bụ onyeisiala ha kwuru nke a. Ọ kpọkwara ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nuklia nke ndị mba Amerịka oku ha bịa jiri anya ha hụrụ ya n'ọnwa Mee N'egwuregwu A kagbuola asọmpị kwesiri ịdị n'etiti otụ bọọlụ Naịjirịa nke obere bụ Flying Eagles na ibe ha nke ndị Bene Ripọblik. Ebidoghị nkwado asọmpị a n'oge bụ ihe kpatara e ji kagbue ya. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ ụtụtụ a na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa A maghị m na Igwe Tupac ga-achake etu a" afirika-55937468,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55937468,Eastern Security Network: Amaghị m maka ha mana ihe e meziri nke ọma dị mma - John Okiyi,John Okiyi bụ kọmishọna mgbasaozi n'Abia Steetị mgbe ọ na-akọwa ọnọdụ nchekwa na steetị ahụ sị na ọ maghị maka 'Eastern Security Network' nke Ipob hiwere.,"Ọ sị mana ọ bụrụ na ESN na-eme ihe ọma n'usoro iwu kwadoro, na ọ dị mma. Okiyi gara n'ihu kwuo na gọọmentị Abia adịla mbụ hiwe ngalaba nchekwa a kpọrọ 'Homeland Security' na ha ebidola ọrụ. Ọ dọkwara ndị Abia aka na ntị ọkachasị ndị bi n'ime obodo ka ha gbadoo anya n'ịchọpụta ndị batara n'obodo ha. Kirie ihe o kwuru n'uju;" afirika-54131997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54131997,Igbo hairstyles: Ụdịrị isi e ji mara ndị Igbo mgbe gboo,"Site n'afọ 1900 ruo ugbua, ọtụtụ ihe agbanweela, mana mgbanwe ndị ahụ abụchaghị nke a tụfuru atụfu.","Otu n'ime ihe ndị ahụ gbanwere bụ isi ọkpụkpa ndị mgbe gboo na-akpabu. A na-akpakwa isi ugbua, mana ọtụtụ ndị amaghị na ụfọdụ isi ndị ahụ bụ ndị a kpara mgbe gboo. Ihe nkiri a ga-egosi gị ụdịrị isi e jiri mara ndị Igbo mgbe gboo. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi." afirika-45812572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812572,APC na INEC ga-agwa ụlọikpe ihe mere ha ejighị nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo,Ụlọikpe akpọkụọla APC na INEC,"Akụkọ dị mkpa taa INEC kagburu ntuliaka imeụlọ mbụ ịwepụta onye ga-azọ oche gọvanọ emere n'Imo steeti Ụlọikpe ụkwụ dị n'Abụja akpọkụọla APC na INEC ha bịa kwuo ihe ha agaghị eji nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ dịka onye ga azọ ọkwa gọvanọ n'APC Imo Steeti. Ụlọikpe a nyere APC na INEC mkpụrụ ụbọchị abụọ maka ịza oku a, maọbụ... Obasanjo ọ gbagharala Atiku? Akụkọ na ekwụ na onye bụ ọkọrọtọ PDP na ntuliaka 2019 bụ Atiku Abubakar na ọga ya Olusagun Obasanjo nwere nzụkọ mmechi ụzọ n'ehihie a. Atiku na Obasanjo adịchaghị mma kemgbe ha hapụrụ ọchịchị na 2007 mana Obasanjo kwuru na ọgbagharala ya. N'ofesi N'afọ 2017, akpọpụtara Dewji dika ọkachasị nwe ego na Africa A tọrola otu aka jiakụ nwa mba Tazania na ụlọ ọṅụṅụ na nkwarị dị an Dar es Salaam isiobodo mba ahụ. Aka kpaara Mohammed Dewji n'isi ụtụtụ a mgbe ọ sị ịgbatị ọkpụkpụ pụta na hotel ya. Ndị uweojii ka na ama imi n'ala ịmata ndị kpara arụ a. N'egwuruegwu, Echiri ya echichi knight n'afọ 2012 maka obioma o na-egosi ndị mmadụ Onyeisi oche Aston Villa bụ Sir Doug Ellis alakwurula ndị nna ya ochie mgbe ọ dị afọ iri itoolu na anọ (94). Ellis sị na ọche eze dịka onyeisi oche Aston Villa ridaa n'afọ 2006. Ka mkpụrụ obi ya zuo ike na ndụkwa maọbụrụ na mkpụrụ obi na-ezuike n'ezie. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Ezinaụlọ: Onye kachasị emefu ego n'etiti di na nwunye? Cristiano Ronald kana agọrọ isi ya Cristiano Ronaldo ka na-agọ ụkwụ na aka na onweghị mgbe ya kwasara Kathryn Mayorga iko n'ike n'afọ 2009. Ọkaiwu Ronaldo na ekwusi ike na akwụkwọ nịịle eji ebo Ronaldo ebubo ahụ bụ nkonukọ ka ekonụkọrọ ha. Gọmenti etiti akpụpụla Ekweremadu ụlọikpe Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị Gọmenti etiti akpụpụla osote onyeisi Sinete bụ Ike Ekweremadụ na onye nnọchite anya Akwa Ibom North East bụ Baseey Akpan ụlọikpe. A na-ebo mmadụ abụọ a ebubo ha na ha ekwuchaghị ka ọ ha ha tupu ha bata n'ọchịchị. Onye ọbụla nwere akụnaụba n'ofesi ga-akwụ ụtụisi Muhammadu Buhari na-ekwusi ike na ya na-anuso mpụ agha Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-eme ka ihe taara onye Naịjirịa ọbụla nwere akụnaụba na mba ofesi akpụ. Atụrụ anya na onye nwere akụnaụba dị otu a ga-ekwuputa ya na ihe akarịghị otu afọ ma kwụọ otuisi so ya. Onye ọbụla mere otu a ga-erite erere pụrụiche. Hurrican Michael akpaala mkpamkpa n'US Hurrican Michael gbukwara ọtụtụ mmadụ n'ụzọ tupu abata mba Amerika Ajọ ifufe akpọrọ Hurricane Michael ji oke ọsọ ruru kilomita narị abụọ abatala na Florida na mba Amerika. Ka ọ dị ugbua, otu onye anwụọla na ya bụ oke ifufe bụ nke mebiri ọtụtụ akụnaụba ndị mmadụ. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa APGA: Ndị Imo tunyere pati APGA na ntuliaka 2019 Akụkọ ga-amasị gị NLC: Anyị ekweghị na puku naira iri abụọ na anọ Zamfara primaries: Anyị nwere ndi ga-azo ọchịchị - APC" afirika-43996733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43996733,Akụkọ kachasị n'abalịa: Buharị na Trump akpaghị maka Biafra,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Otu dị iche iche na-akwado nwere onwe Biafra sịrị ndị ọchịchị Naịjirịa ha ejizila nwere onwe Biafra eti epele Otu na akwado nwere onwe Biafra akọwala ọgbakọ onyeisiala Buhari na nke Donald Trump mba Amerika nwere dịka ọgbakọ na-adịghị asọ. Otu a kwuru ihe a n'Enugu mgbe ha kwara arịrị na onweghị Biafra ha kpara n'ọgbakọ ahụ agbanyeghị ka esi egbụ ọtụtụ n'ime ha na Naịjirịa. Ndị NAFDAC na nyocha ndị ọrụ na-arụpụta Codeine NAFDAC sị na ha na-ebebi ngwaahịa ọjọọ ha jidere Ndị ọrụ na ahụ maka ọgwụ na nri bụ NAFDAC ekwuola na ha amalitela itinye anya nchọpụta na ụlọọrụ anọ ndị ahụ akpọrọ aha ha na ihe onyonyo ndị BBC gosiri. Ihe onyonyo ahụ chọpụtara na ụlọọrụ anọ ndị ahụ dị na Legos, Ilorin nakwa Kano steeti ebe NAFDAC wakporo ụlọọrụ ndị a ma chọpụta na ha emerụọla ala. Ntuliaka ga na-aga n'ihu na UK ugbua. Ebe ụfọdị na UK iwu chọrọ ka ndị mmadụ gosi akwụkwọ njirimara tupu ha eme ntuliaka N'ofesi, ka ọdị ụgbụa, atụm votu na aga n'ihu maka nhọpụta ndị isi okpuru ọchịchị dị iche iche na UK. Ihe dịka oche puku anọ (4000) ka a ga-ahọpụta ndị ga-anọ na ha na ntụliaka a. N'egwuregwu Arsenal na Atletico Madrid ga akụkọrịta mpi n'abalịa Mgbe ikpeazu ndị otu abuo a sọrọ mpi na 26 April 2018 ha gbara onwe ha 1-1 Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo taa Joe Igbokwe sị na ndị Igbo amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị. Asambodo gị o na-enye gị nri ? Akụkọ ndị ga-amasị gị" egwuregwu-50863729,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50863729,Mikel Arteta: Anyị chere na ọbịbịa Mikel ga-ewetarala Arsenal ihe ọma,Kelechi Anyikude amaama ka onye Igbo bi Ingland na-akwado Asernal sị na ọbịbịa Mikel Arteta bụrụ Arsenal ihe ọma maka ihe ọhụrụ ọ ga-ewetere Arsenal.,"Mikel Arteta Mikel Arteta abụrụla onye nkuzi ndị otu egwu bọọlụ Arsenal taa bụ Fraidee, abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba afọ a. Ọtụtụ na-ekwu na Arteta nwere ike ịbụ onye nzọpụta Arsenal na-atụ anya ya. Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ tupu ọ laa ezumike nka. Ọ ga-esonye na nzọụkwụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard bụ ndị gbabuuru Manchester United na Chelsea bọọlụ ma bụrụzie ndị nkuzi ha ugbua. Mana nke a abụghị naanị ihe gbara ọkpụrụkpụ maka nwa amadị a. Ihe iri dịmkpa gbasara Mikel Arteta Mikel Arteta ga-anọchị anya Unai Emery bụ onye Arsenal chụrụ achụ Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe omimi dị na-iru isi dada" afirika-52785914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52785914,Biafra: Ihe Ipob na Massob chọrọ - T.A Orji,"Onye bụbu Gọvanọ Abia steeti ma bụrụkwa sinetọ na-anọchite anya Abịa Sentralụ bụ Theodore Ahamefula Orji, ekwuola uche ya banyere Indigenous People of Biafra (Ipob) na Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra (Massob) na nweta Biafra.","Nke a dị n'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya n'Umuahia, Abia Steeti n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, afọ 2019. Ọ sị na otu ihe mere ndị otu dịka Massob na Ipob ji na-eti mkpu mmegbu bụ na onye Igbo abụbeghi onyeisiala Naịjirịa. Na ọ bụrụ na e nye ndị Igbo ọkwa onyeisiala, na ihe ndị a ga-akwụsị maọbụ dajụọ n'ebe ọ dị obere. Orji gara n'ihu rụtụ aka na nhazigharị obodo bụ ihe e kwesịrị ime iji mee ka ihe dị mma karịa ka ọ dị ugbua. O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọomentị etiti hapụ ụfọdụ ihe dịka uweojii ka ndị steeti jide nke ha. Kirie ihe o kwuru n'uju; Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47561402,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47561402,Imo state: Aga m anabata mkpebi ụlọikpe mgbe m garuru - Uche Nwosu,"Uche Nwosu bụ onye a kpọpụtara aha ya dịka onye gbara onye abụọ na ntuliaka gọvanọ Imo steeti, ekwuola na ọ ga-aga ụlọikpe ịzọ mmeri ọ sị kwesịrị irute ya aka.","Ọ gwara BBC Igbo sị na iwu obodo akwadoghi etu Emeka Ihedioha nke PDP si nweta mmeri, makana o nwetazughi vootu pasentị 25 (25%) n'ime okpuruọchịchị 18 n'ime 27 dị n'Imo steeti. O kwukwara na ọ ga-anabata ihe ọbụla bụ mkpebi ụlọikpe mgbe ọ garuru. Maka etu ndị na-akwado Ihedioha si na-adọkasị mbadamba e sere ihu ya o ji chụọ nta vootu, Nwosu kwuru sị na ọ gwakwara ndị nke na-akwado ya ka ha ghara iso kpaa ụdịrị agwa ahụ maka aka o binyere n'ime akwụkwọ nkwekọrịta udo ""peace accord"". O kwuru na ihe dị mkpa bụ ka udo chịa n'Imo steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" media-44372825,https://www.bbc.com/igbo/media-44372825,JOHESU: Ụlọọgwụ UNTH amalitela ọrụ n'uju.,"Ndị ọrụ so na otu JOHESU akwụsila abụbọ ọrụ ahụ ha malịtere izu ụka atọ gara aga.BBC gara na ụlọọgwụ UNTH dị n'Enugwu iji chọpụta ka ọrụ si aga, wee hụ na ndị ọrụ amalitela n'uju.","Ụlọogwu UNTH Enugwu sọ n'otu n'ime nnukwu ụlọgwụ gọọmenti etiti hiwere na mpaghara dị cie iche na Naijiria Ngalaba dịka nke ndị si n'ụlọ abịa nleta nke a kpọrọ ""out patients"", nke nleta mkpụrụobi (Heart center) nakwa nhazi(Administration) bụ nke ndị ọrụ juru na ya. Otu Nwanyị bịara ụlọọgwụ ahụ bụ Cecilia Anyachebelu kelere Chukwu na gọọmentị na ndị ọrụ enwela nghọta nke mere na ya du nwa ya nwoke nwere oghere n'obi were bia maka iwa ya obi.Nwanyị ọzọ kpọ nwa ya bịa na UNTH bụ Okwudili Iloputaife kwuru na obi dị ya ụtọ na abụbụọrụ ahụ ebiela. Ndị JOHESU na-ana gọọmentị ọtụtụ ihe dị iche iche nke gụnyere ụgwọ onwa gbagotere karịa ka ọ dị ugbua nakwa ihe ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52866549,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52866549,Justice for Uwa: 'A kwụrụ anyị otu nde Naịra iji gbuo Uwa Omozuwa',"Aka ndị uweojii Edo steeti akparala mmadụ isii a na-enyo n'aka ha dị n'ọnwụ Vera Uwaila Omozuwa, nwa mahadum 'University of Benin.'","Ndị a mabụghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo Uwa n'ụlọụka ndị 'Redeemed' dị nso n'ụlọ ha na Bini ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ n'abalị. Ndị uweojii nwụchiri ma kpụtụta n'ọha; Collins Uligbe,Mary Ade,Nelson Ogbebor,Akato Valentine, Tina Samuel na Nosa Osabohien maka ebubo aka ha ịdị n'ọnwụ nwata nwaanyị ahụ na-agụ 'Microbiology' n'Uniben. Collins Uligbe, onye kwuru na ọ bụ Mary Ade, onye nwe Ulọ ebe bụ sị ""Onye nyere anyị otu nde Naijiria iji gbuo Uwa ma were ịchafụ aka fichara ọbara ya ga-enye onye dunyere anyị ọrụ."" Ọ gbakwara akaebe na Oriakụ Ade nyere aha gbuo nwata ahụ n'ihi na okwuru na nwata ahụ bụ ezi nwata, naụlọụka ha na-akpọ ya n'ihe niile ha na-eme. O kwuru na ọ bụ igwe e ji emenyọ ọkụ(fire extinguisher) ya ya jị kụọ Uwa ugboro ugboro. Nosa Osabohien bụ onye zụrụ ekwenti Uwa bụ ihe ndị uweojii ji nweta ndị gburu Uwa kwuru na ya zụrụ ekwentị ahụ N17,000. Cheta na e dinara Uwa n'ike ma kụọ ya ihe hapụrụ ya n'ọnụ ọnwụ n'abalị iri na atọ nke ọnwa Mee, afọ 2020, ebe ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ 'University of Benin Teaching Hospital' n'Abalị iri atọ na otu ọnwa ahụ. Ngagharịiwe sochiri ọnwụ ya dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa otu ụmụnwaanyị kpọrọ oku ka a chọta ndị gburu ya ma taa ha ahụhụ dịka iwu si dị nke gbalitere mụọ onyeisiala Muhammadu Buhari inye ntuziaka ka a chọta ndị gburu Uwa. Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka mnwụchie a nwụchiri ndị a Ụfọdụ ụmụ Naijiria dịka Wendy toro ndị uweojii maka ""ike ha kpara."" Ụfọdụ nddị ọzọ dịka Omoluabi kpọrọ oku ka ndị uweojii gaa n'ihu kpụpụ ha ụlọikpe. Ụmụnwaanyị Igbo ekwuola ihe ha ji mee ngagharịiwe n'Edo steeti gbasara Uwa Omozuwa Ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Uwavera Onyeisi ndị Women Aid Collective (WACOL) bụ Joy Ezeilo ekwuola ihe mere ha jiri buru ngagharịiwe gawa Edo steeti ịdọnyere ezinaụlọ Omozuwa nakwa ụmụnwaanyị niile n'ụwa gbaa gburugburu ukwu maka agha ana ebuso mpụ mwakpo ụmụnwaanyi. Ezeilo sị na ""mwakpo anaghị akpa oke. Ka o si metuta onye ukwu bụ ka o si metuta onye nta"". O sị na ọ bụ maka ya kpatara ha jiri rịọ nkwado ndị Actionaid nakwa nke ndị Canada ka ha nyere ha aka n'iti ya bụ mkpu ka o ruo ụwa ntị. Ezeilo sị na ọ bụ ndị obiọjọọ butere asịrị imebi aha Uwa site n'ịsị na ya bụ nwaagboghọ butere afọime tupu awakpo ya. Ọ sị na obi dị ya ụtọ na nchọpụta gosiri na onweghị ime ya bụ nwa dị. Gee ya ntị n'olu ebe a. Justice for Uwa: Ụwụnwaanyi Igbo mere ngagharịiwe gbasara Uwa Omozuwa Nna Uwavera gwara BBC okwu mgbe ha gakwuru ya n'ụlọ ha na Benin. Onyeisioche ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi bụ Abike Dabiri Erewa depụtara n'akara twitter ya na ndị uweojii nọ n'Edo steeti anwụchiela otu onye a na-eche n'aka ya dị na mwakpo na ogbugbu Vera Uwaila Omosuwa. O kwuru na onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Edo steeti bụ Chris Nwabuzor kwuru na anwụchiri onye ahụ ka enyochara mbinyeaka a hụrụ n'igwe eji emenyu ọkụ. BBC Igbo gbaliri ka ha nụta n'ọnụ Chris Nwabuzor mana o bughị ekwenti ya nke o ji azaa ozi anyị zitere ya n'ekwenti. Cheta na ụịmụakwụkwọ apụtala mee ngagharị iwe maka ogbugbu na mwakpo Vera Uwaila Omosuwa. Otu onye gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ mgbe niile ka na anụ akụkọ maka mwakpo ụmụnwaanyị kama enweghị ihe a na-eme ndị ejidere. Onye a gara n'ihu na-ajụ ""Uwa ọ na-enweta ikpe ziri ezi ka ndị a ha a ga-ala n'efu"". Lee ya ebe a Emeela ngagharị iwe maka ogbugbu Uwavera n'Edo steeti Ndi uweojii ekweela nkwa ijide ndị gburu Uwavera Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ga-ezipu ndị nkwado na ihe eji eme nyocha iji chọpụta ndị gburu nwaada Vera Uwaila Omosuwa. Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na eti mkpụ ma na-ewe iwe maka ogbugbu na mwakpo Uwalia nke mere n'Edo steeti nso nso a. Onyeisi ndị uweojii katọrọ ya bụ ihe dịka ọ na-eti ezinụlo Uwaila na ndị enyi ya aka n'obi ma kwee ndị mmadụ mkwa na ndị uweojii ga-ejide ndi mere ya bụ arụ n'oge na adịghị anya. Ihe ndị ụka RCCG kwuru Dịka ndị mmadụ na-eti mkpụ na-ebeku gọọmenti maka ịkpe nkwụmọtọ n'isi nwaada Uwavera bụ ndị omekome napụrụ ndụ n'ike ụbọchị Wenezde gara aga, ndị ụka ya bụ Redeem Christian Church of God ekwuola okwu gbasara ya bụ arụ mere n'ogige ha na Benin, Edo steeti. N'akara Twitter, RCCG sị na ha kagburu ma katọọ ya bụ arụ mere ma na-akpọkụ ndị uweojii ka ha nye aka chọpụta ndị kpara ya bụ arụ. Uwavera Omozuwa dị afọ iri abụọ na abụọ nwụrụ n'ọdachị e chere na ọ bụ mwakpo n'ike mere n'ụlọụka dị na Benin. Kedụ ka o si nwụọ? Nwaane ya nwaanyị bụ Judith gwara BBC news na Uwa bụ onye ka banyere mahadum ọhụrụ a gara ịgụ akwụkwọ n'ụlọụka Redeemed Christian Church of God dị n'akụkụ bee ha mgbe a wakporo ya n'ike. Justice For Uwa: 'Uwa yi akwa m ụbọchị a wakporo ya n'ụlọụka' O kwuru na Uwa na-ejekarị ụlọụka ahụ eje agụ akwụkwọ makana ebe juru oyi. Ụbọchị awakporo ya , ọ gara ebe ahụ ịgu akwụkwọ dịka o si eme na mbụ. O kwuru na ka elekere isi nke mgbede kụchara, otu onye n'aka ụlọụka ahụ kpọrọ nne ya n'ekwenti si ya bịa na ha amaghị ihe mere nwa ya nwaanyị makana ha hụrụ ya n'ikpo ọbara, ebe siketi na ọbante ya dọkara adọka, ọbara juru sheeti ya. N'okwu nwaane ya nwaanyị, a wakporo ya, ọ bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke, o dịnatụbeghị nwoke na mbụ."" Tupu ndị bee ha eruola n'ụlọụka, a gwara ha na ebugala ya ụlọ ọgwụ. Judith kwuru na ndị ọrụ nchekwa anọghị ya mgbe ihe mberede a mere. "" Ọ nọ n'igwe na-enyere ya aka ikute ume n'ụlọọgwụ ụbọchị atọ tupu ọnwụọ."" BBC news gbaliri ịnụta n'ọnụ nne na nna Uwavera mana Judith kwuru na obi mgbawa ekweghị ha ikwunyere onye ọbụla. ""Ihe ha chọrọ bụ ka a chọpụta ndị rụrụ ala a ma ma ha ikpe ruru ha."" Ihe ndị uweojii kwuru maka ọdachị a Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Edo steeti bụ DSP Chidi Nwabuzor gwara BBC na etu ndị mmadụ si ekwu na ọ bụ mwakpo n'ike gburu Uwavera nwere ka ọ dị. O kwuru na mgbe ọ kpọrọ DPO na-elekọta Ikpoba Hill, ọ gwara ya na ọ bụ ọgụ dapụtara n'etiti Uwa na ndị agboro. Nwabuzor kwuru na ọgụ ahụ mere n'ime ụlọụka tupu akpọrọ ya gawa ụlọ ọgwụ ebe ọ nọ nwụ mana DPO kwuru na ọ ga-ewetere ya akụkọ zuruoke ka ya bụ ihe si mee nke o na-eche ka ewetere ya. O kwuru na ha na-ahụ ya bụ ọdachị dịka nke ọgụ butere. Soshal midia nwuru ọkụ maka akụkọ a Kamgbe akụkọ a pụtachara, Justice For Uwa na-ewu. @Ebuka kwuru na ya bụ akụkọ na-agbawa obi nke ukwuu. @ozzyetomi kwuru na udiri ihe a ekwesighị ime Uwa. A na-ekwu ka a na-ekwu ndị ụka Redeemed Christian Church of God, RCCG, dee n'akara Twitter n'ehihie Satọde a, na-arịọ ka ndị mmadụ kpewere onyeisi ha bụ Pastor Adeboye ekpere. Twitter/RCCG Ya bụ okwu atọghị ndị mmadụ ọchị ma ọlị. Ha gosiri nke a site na-ịwụ ha ọnụ na-asị na ha ekwesighị ịde ihe dị otu ahụ ebe e gburu onye otu ha n'ime ụlọụka ha. N'obi ha ndị ụlọụka a kwesiri ide maọbụ kpọọ oku maka ikpe nkwụmọtọ n'isi nwaagbọghọ a anapụrụ ndụ n'ike, karịa ikwuwe okwu onyeisi ha dịka #JusticeForUwa na-ewu kemgbe ụtụtụ . Leekwe ụdị ihe ha dere ebe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49336156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49336156,Herdsmen clash: Ndị ochiehi abụọ emerụọla ahụ n'ọgụ ehi na-efu efu n'Owere,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ndị Fulani ọchịehi merụrụ ahụ maka okwu ehi na-efu efu na-anata nleta n'ụlọọgwụ ugbua.,"Ndị ochiehi abụọ enwetala onwe ha n'ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre', Owere maka okwu gbasara ehi na-efu efu. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu onye Fulani ọchịehi gara n'ohịa ebe nwanna ya na ehi ya nọ were sụọ ya mma ka ọ na-arahụ ụra, kpọrọ ehi ndị o nwere gbalaga chee na onye ọ sụrụ mma anwụọla. Mana onye Fulani ọchiehi ọzọ hụrụ ihe mere bekuru ndị ọchịehi ndị ọzọ were mma sụkasịa ya ma nata ya ehi ndị o zuru. Ikeokwu kọwara na ""Ọ bụ ndị obodo kpọrọ ndị uweojii si 'Agbala Police Division' oku ndị buru mmadụ abụọ ndị a buga ha ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre', Owere n'ihi nghọtahie gbasara ehi na-efu efu."" Akụkọ ga-amasị gị:" 42937964,https://www.bbc.com/igbo/42937964,Tanka bu ndịọrụ mba India efuola na mpaghara Bini,Tanka mmanụ bu ndịọrụ Indịa ruru iri abụọ n'abụọ efuola na mpaghara mmiri a na-akpọ Gulf of Guinea n'ọnụ bekee na mba Bini na ọdịda-anyanwụ Afịrịka.,"Egwu dị maka ndị ohiụgbọmmiri nwereike iji ụgbọ Tanka a. Anụbeghị olu ụgbọ ahụ edenyere aha na mba Panama kemgbe ụbọchị Tọọsday. Nke a na-abịa ka akụkọ yiri ya mere n'ihe erughi otu ọnwa n'afọ Jenụwarị ebe ndịohiụgbọmmiri kpụụrụ otu ụgbọ ma hapụkwa ha ebe ndị nwe ya kwụrụ ụgwọ mgbapụta. Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọmmiri kwuru na ndịagha mmiri mba Bini na-achọ ụgbọ ahụ bu mmanụ ụgbọala ruru puku iri na atọ n'ọnụ ọgụgụ 'tonne'. Minista na-ahụ maka ihe gbasara India na mba ndị ọzọ kwuru nke a n'elu igwe okwu Twitter: End of Twitter post, 1" media-53891880,https://www.bbc.com/igbo/media-53891880,"Ihe mere n'etiti ndí uweojii na ndí Ipob n'Emene, Enugu state",BBC Igbo nọ n'Enugwu oge ndị otu 'Indigenous People of Biafra' na ndị uweojii lụrụ ọgụ na mpaghara Emene.,Ọgbaaghara a dapụtara oge ndị uweojii wakporo ebe ndị Ipob na-eme ọgbakọ wee chụsasịa ha. Gere ihe onye ntaakụkọ anyị hụrụ gbasara ya bụ ọdachi. Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara na Chiemela Peter Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: mba-uba-43475442,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43475442,Ogunseye: 'Akụkọ anyị ga-emetụ gị ebe ọbụla ị nọ',"Onyeisi Ọdịda Anyanwụ mba Afrịka nke ntaakụkọ BBC bụ Toyosi Ogunseye ekwuola na akụkọ BBC n'asụsụ Pidgin, Yoruba na Igbo ebutela ihe dị iche n'ụzọ esi agbasa akụkọ n'ala Naịjirịa na Afrika.","Ogunseye: 'Akụkọ anyị ga-emetụ gị ebe ọbụla ị nọ' Ogunseye kwuru na ụlọọrụ BBC bụ ụlọọrụ nke mbụ ga-agbasa akụkọ n'asụsụ a na Naịjirịa. N'okwu ọnụ ya: ""ma ọ bụrụ na ịnaghị asụ bekee, ma ọ bụrụ na pidgin ma ọ bụ Igbo ma ọ bụ yoruba ka ị n'asụ, akụkọ anyị ga-erutegi aka. Nke a mere ka akụkọ anyị n'asụsụ ọhụrụ a ji dị ezigbo mkpa."" Ihe ọhụrụ a BBC mụpụtara dịkwa ndị na-asụ asụsụ Frenchị mkpa makana ha ga-anụ akụkọ pụrụịche, nke anụbeghị n'oge garaaga. Ogunseye kwuru: ""ebe ọbụla n'ala ndị n'asụ asụsụ Frenchị ị nọrọ, akụkọ BBC ga-erute gị na'ebe ahụ."" Mmeme a anyị na-eme echi bụ maka ị kele ndị enyi anyị niile n'ime ọrụa maka ihe ọma niile ha mere na-afọ iri isi na otu garaaga." 47696864,https://www.bbc.com/igbo/47696864,Emeka Ihedioha: Ndị ụlọomeiwu Imo steeti a ga-enye ọchịchị ya nkwalite?,"Dịka okwe sị nwe gba maka ndị ahọpụtara ị ga ụlọmeiwu Imo steeti nke bụ na PDP nwere mmadụ iri na atọ,","AA nwetara mmadụ asatọ,ebe APGA nwetara mmadụ isii, ajụjụ bụ o ga-emetụta nkwkọrịta ịkwalite ọchịchị Ihedioha. Ụfọdụ ndị sara BBC Igbo ajụjụ ahụ kwuru na ọ gaghị ebute nsogbu ọbụla, ebe ụfọdụ sị na ọ ga-enye nsogbu. Akụkọ ga-amasị gị:" 42789183,https://www.bbc.com/igbo/42789183,Ọnụ na-ekwuchitere Buhari asabeghi ihe ọbụla gbasara akwụkwọ edemede Ọbasanjọ degaara Buhari,"Ka akụkọ edemede onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo degasịrị onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-ewuewu, mbọ niile BBC Igbo gbara maka ịnụ ihe ndị nọ n'oche ọchịchị ga-ekwu maka okwu a lara iyi n'ihi na ha asaghị.","N'ime akwụkwọ Ọbasanjọ degaara Buhari, Ọbasanjọ kwuru na APC na PDP bụ otu ihe, wee kpọkuo otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ ka ọ malite. Dịka ọtụtụ ndị n'ekwenye na akwụkwọ a Obasanjo degara onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ọ bụ ihe ziri ezi, ụfọdụ ndị akatọla ya, kwuo na Obasanjo bụ onye ama ama n'idegara ndị isiala akwụkwọ. Ugbua ka anyị were ohere a nyocha ihe ndị pụtara ihe na akwụkwọ a nke Obasanjo zigara onyeisiala Buhari nke ọkpọrọ igwu dịna emeghị nkeọma Gọọmenti etiti, Mana nke a akwụsịghị ndị mmadụ ikwu obi ha gbasara okwu a ọkachasị Gọvanọ Ekiti bụ Ayọ Fayọse na ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ: Akụkọ a ka ga-abịa." 42782899,https://www.bbc.com/igbo/42782899,Ejima atọ anwụọla na Jigawa Steeti,Onye na-ekwuchite ọnụ ngalaba na-ahụ maka nchekwa a na-akpọ NSCDC bụ Adamu Shehu kwuru na nke a mere n'obodo Hadejia na Jigawa.,"Ịhe a eji esi mmiri nwere ike ikpata ọkụ ọgbụgba Ọ gwara ndị ntaakụkọ News Agency of Nigeria na ihe kpatara ọkụ a bụ mgbe ọkụ latrik bidoro igba n'igwe eji esi mmiri ọkụ, ma ọkụ ahụ malitere ịgba mgbe oji nkeji iri anọ n'ise gafee elekere iri nke abanyị Aha umu nwanne ahụ nwụrụ bụ Hassan, Hussain na Muhsin Sale. Nwanne ha nwoke bụkwa Aliyu Sale nwụkwara. Shehụ si na ọkụ nke a bidoro n'ụlọ nke ejima atọọ a, were gbakwa ịhe ndị ọzọ dị na gbụrụgbụrụ ebe ahụ. Ọ dọkwara aka na ntị si ndị mmadụ kpachara anya na ịhe ndị latrik karịcha oge ụgụrụ a." media-52918197,https://www.bbc.com/igbo/media-52918197,Lejja Town: Ị ma na a na-akpụ ụzụ n'ala a n'afọ 4000 gara aga?,Obodo Lejja bụ ebe ọtụtụ mmadụ amaghị na a na-akpụ ụzụ n'oge gboo.,"Mana onye ọkammụta n'ihe gbasara ""Archeology"" maọbụ igwuputa ihe ndị dị n'ala, kọwara etu e si chọpụta ebe a. Lee ihe onyonyo a ka ị hụ ihe ndị tụrụ n'anya si n'obodo a were pụta. Ndị mere ihe onyonyoa a bụ Chiemela Peters na Ikechukwu Kalu Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-47479355,https://www.bbc.com/igbo/media-47479355,International Women's Day: 'Agaghị m ata onwe m ụta na m bụ nne na-arụ orụ- Ngozi Nwobia,"N'ọgbara ọhụrụ a, ụmụnwaanyị bụzi ndị na-achụ ego ma na-elekọtakwa ezinaụlọ ha anya.","Ụfọdụ oge ọ na-abụ ha ihe rara ahụ dịka oge na-agbanwe n'ike n'ike. Mana Ọkammụta Ngozi Nwobia,Ọkammụta Sayensi asụsụ na Mahadum Ebonyi steeti akọwala etu o si eme ka ha abụọ hara nha. Lee okwu ya n'uju ebe a." afirika-54562212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54562212,Bishọpụ Paulinus Ezeokafor etinyela ọnụ na ngagharịiwe END SARS,Bishọpụ Paulinus Ezeokafor bụ bishọpụ ndị Katọlik nke Ọka Dayọsis etinyela ọnụ n'ihe gbasara END SARS.,"O kwuru na ọ bụ emeghi ihe mgbe e kwesịrị ime ya na-ebute mmebi ihe. O kwuru na ndị SARS emekarịala ihe e dinyere ha, mere ka ndị ntorobịa wewe iwe a ha na-egosi ugbua. Bishọpụ gara n'ihu kwuo na ndị ntorobịa ekwuola uche ha, ndị isi anụ, na ọ ga-adị mma ịkwụsịlata ugbua." afirika-44048451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44048451,Dino Melaye: Ndị na-akpagbu ya na-emegide obodo - Mao Ohuabunwa,Omeiwu Mao Ohuabunwa gwara BBC Igbo na ihe na-eme Dino Melaye bụ ihe na-agba anya mmiri.,"O gakwara n'ihu kwuo na ndị mba ọzọ na-achị Naịjirịa ọchị maka ihe a. O gwakara anyị na ihe mere n'ụlọ onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ ihe nwute makana ọbụghị agwa ndị Igbo. Ma kwukwa na o gosiri na Maazị Nwodo na-amịta mkpụrụ ọma, makana ọ sọsọ osisi na-amịta mkpụrụ ọma ka a na-ama okwute. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43787107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43787107,A na-ekwu na ndị Shiite na-ebuso ndị uweojii agha,Ihe onyonyo a Sunday Mgbor nọ Abuja sere site na mgbo ya gosiri ka ndị Shiite ji osisi eti n'ụgbọala ndị uweojii dxịka ndị uweojii ji gasị anyammiri achụsasị ha.,"Ndị Shiite bụ ndị okpukpe dị na Islam, e ji onyeisi ha Ibrahim El-Zakzaky kamgbe afọ abụọ gara aga. Ngagharị iwe ha bụ iji gwa onyeisiala Buhari ka a tọhapụ El-Zakzaky mana ngagharị iwe ha abụghịzị nke udo dị ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ na twitter kwuru na ha na-emebi ụgbọala ndị mmaọ̄ụ ma na-ebutekwa ọgbaaghara n'akụkụ Unity Fountain dị n'Abuja. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45605869,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45605869,Iri ji na mgba azụeruala,Mgba a bụ ihe a ndị Igbuzo dị na Delta steeti na-eme afọ ọbụla maka nkwadebe iri ji ọhụrụ.,"Igbuzo na-agba mgba a otu oge n’ime afọ niile. Ndị na-eso na mgba a bụ ndị ruru bido afọ iri ruo afọ iri anọ. N’oge gboo, ha na-eji mgba a edozi esemokwu. Ha na-ejikwa mgba a ama onye kachasị ike n’obodo ahụ. Ha na-eji ohere emume ahụ ama onye ọrụugbo bụ ọkaibe n’ọrụ ya. Akụkọ ga-amasị gị" 42929115,https://www.bbc.com/igbo/42929115,West Ham achụọla Tony Henry,West Ham achụọla Tony Henry bụ onye na-ahu maka ịhọpụta ndị ọhụrụ na-agbara otu egwuregwu ahụ bọọlụ n'ihi na o kwuru na ya ga-akwụsị ị nabata ndị egwuregwu bọọlụ si mpaghara mba Afrịka.,"West Ham kwuru na ha nyochara ya bụ okwu tupu ha chụọ Tony Henry. N' akwụkwọ ozi ha, West Ham kwuru na ha ekwetaghị n'ikpaoke agbụrụ. Mana onye nkuzi ha bụ David Moyes kwuru na tupu a chụọ Henry, ọ họpụtara ndị egwuregwu bọọlụ abụọ sị na mpaghara Afrịka. West Ham kwuru na ugbua ha chọrọ ị zụ Islam Slimani bụ onye ala Algeria ya na Ibrahim Amadou, onye ala Kamerun. Otu ndị na-agba bọọlụ akpọrọ 'The Professional Footballers Association' na olu bekee kwuru na okwu ọnụ Tony Henry jụrụ ha n'anya. West Ham nwere mmadụ isii ndị Afrika ndị na-agbara ha bọọlụ. Ha bụ; Cheikhou Kouyate, Pedro Obiang, Joao Mario, Angelo Ogbonna, Arthur Masuaku na Edimilson Fernandes." 45856933,https://www.bbc.com/igbo/45856933,Ndị Abatete bi na Lagos mere ihe puru iche na mmemme iri ji ọhụrụ ha,Ọtụtụ ụmụafọ ndị Abatete n'ime Anambra steeti biri na Legọs steeti putara n'uju maka mme mme iri ji ọhụrụ.,"Ha gwara BBC Igbo na emume iri ji ọhụrụ di ezigbo mkpa n'ala Igbo, nke mere na ha na-akwadebe maka ya nke ọma afọ niile agbayeghị na ha biri na ala Legọs. Lee ihe nkiri mme mme a ugbua. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chris Sanctus Okereke" afirika-48851787,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48851787,Anambra state: A machiela keke,Akụkọ dị mkpa ụbọchị Fraide (5-7-19):,"Anambra steeti akwụsịla Keke Gọọmenti Anambara steeti amachiela otu ndị keke a kpọrọ ""Tricycle Owners Association of Nigeria"" na steeti ahụ. Kọmishona ime njem dị n'aka bụ Uchenna Okafor kwuru na nke a dị mkpa maka arụ na mpụ e ji ya bụ keke eme na steeti ahụ. Abba Kyari na Boss Mustapha alọghachitela n'ọrụ Onyeisiala Buhari na Abba Kyari Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọrọla Boss Mustapha ka ọ rụrụ ọrụ gawa dịka odeakwụkwọ nke gọọmentị. Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garụba Shehu gbara ama a n'akwụkwọ ozi o zipuru n'uhuruchi Fraidee. Shehu kwukwara na Buhari họrọkwaara onye isi ndị ọrụ ya bụ Abba Kyari ka ọ rụrụ na-aga. Mustapha na Kyari bụ ndị mbụ Buhari na-ahọputa ga-eso ya rụọ ọrụ n'agba nke abụọ nke ọchịchị ya. Amabeghi mgbe onyeisiala ga ahọpụta ndị mịnịsta ga-eso ya arụ ọrụ. Otu onye uweojii anwụọla ebe ha na ndị omekome na-akwarịta mgbọ Otu onye uweojii n'Anambra steeti atụnyela isi ya ebe ha na-achụ ndị ntọ ha si ji onye nkuzi kọleji ndị nkuzi Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe bụ Pascal Achugbu. Onye uweojii a aha ya bụ Moses Jacob nke Anti Robbery Squad nke akara ya bụ F/No 444849 lara mgbe ha na ndị ojiegbeezụ kwakọrịtara mgbe n'ụzọ Abba /Ukulu dị na okpuruọchịchị Dunukofia n'Anambara Steeti. Achugbu na otu onye ha sị na o so na ndị ojiegbeezụ ka mgbe tụrụ. Ha abụọ nwụru na ụlọọgwụ ebe adọwara ha na ọbaozu ugbua dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti siri kwuo. N'abalị Tọzde ka ndị ntọ tọrọ Dọkịnta Pascal Achugbu nke bị na 26 Ngozika housing Estates Awka. A ka na-achọ ya bụ nwa amadị achọ ugbua. Oyetola emeriela Adeleke n'ụlọikpe kacha elụ Ademola Adeleke nke PDP anabatala mkpebi Ụlọikpe Kachasị na Naijiria na ọ bụ Gboyega Oyetola meriri ntuliaka nke gọvanọ Osun steeti emere n'afọ 2018. Ndị okaiwu ise n'ime asaa kwetara na ya bụ ntuliaka e mere na Septemba 2018 kwụ ọtọ ebe mmadụ abụọ si na wuruwuru dị na ya. Iran na ụgbọmmiri Briten N'ofesi e, otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Mohsen Rezaei agwala mba Iran ka ha kpachie ụgbọmmiri mmanụ agbidi ndị Briten ma ọ bụrụ na ha ahapụghị nke ndị Iran ha ji. Cheta na ụbọchị Tọzde, Royal Marines nke ndị Briten nyere Gibraltar aka ịkpachi ụgbọmmiri ndị Iran ha sị na ọ na-aga Syria isi mmanụ agbidi. Ikpe gọmenti na Deziani Ụlọikpe ukwu dị na Steeti Legọs enyela iwu ka eweghachiri gọọmentị etiti ekwentị iPhone nakwa ọla e ji achọ mma bụ nke a napụtara Diezani Alison-Madueke. Okaikpe Nicholas Oweibo nyere iwu a ụbọchị Fraidee ka gọọmentị weghara ihe ndị ahụ nke a sị na ọpụtara ego di nde dola iri anọ ($40 million). Alison-Madueke bụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi oge Goodluck Jonathan bụ onyeisiala. Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ Economic Crimes Commission boro Alison-Madueke ebubo izupu ego buru nnukwu ibu oge ọ bụ Mịnịsta. Ma Alison-Madueke ekwolari na nke ahụ abụghị eziokwu mana okwebeghi ịlọta Naijiria bia zara ọnụ ya. N'ụbọchị Fraidee, ọkaiwu ndị EFCC bụ Rotimi Oyedepo rịọrọ ọkaikpe ahụ ka o nye iwu ka gọọmentị weghara ọla ndị ahụ. Ọla ndị ahụ gụnyere ""ọla aka (bangles) 419; ọla mkpịsị aka (rings) 315; ọla ntị (earrings) 304; ọla olu (necklaces) 267; dgz. Ọkaikpe ahụ nyere abalị iri na anọ ka onye nwe ekwentị na olandị ahụ bịa kọwaa onwe ya, ọbụghị otu a, gọọmentị ga-eweghara ihe ndị ahụ kpam kpam. Arjen Robben alaala ezumike nka Arjen Robben Ụmụibe, n'egwuregwu, onye mbi egwu bọọlụ kwọchara isi bụ Arjen Robben alaala ezumike nka na ya bụ egwu ọ maara agba. Ya bụ onye egwu sị Netherlands gbaara Bayern Munich na Chelsea dị afọ itoolu malite egwu bọọlụ dịzị afọ iri atọ na ise ugbua ọnwụsara ọwa. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mikel Obi gbaara otu Chelsea bọọlụ tupu ọ gaa Chaịna Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na Mikel Obi agaghị esonye na agbam bọọlụ n'etiti Naịjirịa na Kameroon n'ihi na omeruru ahụ. Rohr kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ọgbọ egwuregwu Alexandria dị n'Egypt. Ọ kwuru na odoro ya anya na ndị bọọlụ mba Kameroon bụ ndị siri ike mana ọgbara ndị mmadụ obi na ha enweela ohere ụbọchị old ma old iji zuo ike ma kwadokwaa maka agba nke egbe buru ọlaa. Gernot kwuru na ndị niile nwebụrụ mmerụ ahụ oge gara aga enwetachaala onwe ha were kwuo na ọ nanị Mikel bụ onye nwetara mmerụ ahụ ọhụrụ.Troost Ekong bụ onye ya na Coach Rohr nọ na mkparịtaụka ahụ Kwere nkwa na n'agbanyeghị na Kameroon bụ obodo siri ike ma bọlụ na ndị Naijiria dị nkwadebe maka imeri ha. Dịka Nafdac siri depụta n'akara Twitter ha, ndị mmadụ kwesiri ịweghachi 'Eva Water' niile rue mgbe nyocha ga-ebi. Ha kwuru na ọ bụ maka nchọpụta ha mere gosiri na agwa mmiri ahụ agbanweela. Nafdac kwukwara ka ndị mmadụ weghachi mmiri ahụ niile n'ụlọọrụ NBC bụ ndị na-arụpụta ya. NBC bụ Nigeria Bottling Company na-arụpụtakwa mmanya ndị ọzọ na Naịjirịa. AFCON abanyela agba nke abụọ ya Ọ bụ taa ka a ga-amalite agba nke abụọ n'iko Mba Afịrịka Moroko na Bene nakwa Uganda na Senegal bu ndị ga-asụ mpị taa. Super Eagles ga-ezute Kameron echi, mana onye nkuzi ha bụ Gernot Rohr ekwuola na agaghị ekwe ka ndị mmadụ bịa ebe ha na-eme nkwado. Rọhr sị na nke bụ ịnye ha ohere itinye uche n'ihe ha na-eme. Igbo gee ntị Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo asala mmanye otu akpọrọ Coalition of Northern Groups manyere Gọọmentị Naịjirịa ka oweghachite atụmatu Ruga. Nwodo sị na okwu a onye aha a bụ Abdulazeez Suleman kwuru adịghị mma ma ncha. Ọ sị ka ndị Ọwụwa Anyanwụ mụrụ anya. Na Libya, A ga-akpọ ndị steeti ha bịa kpọrọ ha ma ha denye cha afa ha. Ngalaba na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ sị ndị Naịjirịa itoolu sọ n'ime ndị nwụrụ mgbe ụgbọelu tụrụ ogbunigwe n'ebe ndị na-agba ọsọndụ n'anọ na mba Libya. Ha sị na ha akpọrala otu nwata, ụmụnwaanyi atọ na otu nwoke bụ ndị Naịjirịa nọ ebe ahụ. Na mba Sudan, Ndị agha nara ọchịchi na mba ahu na ndị isi ndị na-emem ngagharị iwe enwela nkwekọrịta ike ọchịchị tupu eme ntuliaka. Ha nwekwara nkwekọrịta na ha ga-enyocha ọgbaghara daara na mba ahụ n'izu ole ma ole gara aga. Ka ozi nkwekọrịta ruru ndị mmadụ ntị, ọtụtụ bidoro nwebe aṅụrị. Gee nkeji ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-53243543,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53243543,"""Amụghị m ịma mbem amụ, ebu m ya pụta ụwa""","Ịma mbem so na ihe dị ezigbo mkpa n'omenala Igbo, mana ọ bụ ndị okenye na-emekarị ya n'ihi na ihe dị na ya dị ukwu.","Ọ bụ ihe ịtụ n'anya ma dịkwa ezi ụtọ n'obi ịhụ nwata dị afọ 24 ebe ọ na-ama mbem ma na-emeta ya nke ọma. BBC Igbo jụrụ nwata a bụ Igwe Credo etu o siri malite ya bụ aka ọrụ bụ nke ndị okenye, mana o kwuru na ụwa ya lọrọ mere ya ji ama mbem. Ya bụ okwu ka ụtọ n'ọnụ ya. Gere ya ebe a: Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo Akụkọ ndị a ga-amasị gị:" 43876259,https://www.bbc.com/igbo/43876259,"EFCC anwụchiela Sinetọ Nwaoboshi, Jang","Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka nke a na-akpọ EFCC anwụchiela onye na-anọchite anya Delta-North n'ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sinetọ Pete Nwaoboshi, maka ebubo imefu ijeri naira isii.","EFCC na-enyo Pete Nwaoboshi bụ onye na-eso gọvanọ chịbụrụ Delta Steeti bụ James Ibori kemgbe afọ abụọ EFFC bidoro inyo Nwaoboshi, ka ndị mmadụ degaara ha akwụkwọ mkpesa banyere ya nke gunyere ebubo na o nyere ụlọọrụ iri na ise ndị a na-ekwu bụ nke ụmụnne ya na ndị enyi ya nwe, ma bụrụkwa ụlọọrụ aha ha adịghị n'akwụkwọ nke gọọmentị ọrụ ngo ruru N3,483,144,000, maka ịzụ oche n'ụlọakwụkwọ dị na steeti dị na Niger-Delta. A na-ebokwa Nwaoboshi ebubo na o mefuru ijeri naira 1.2 bụ ego ebitere ụlọakụ, ma zụkwaara Delta steeti ngwaọrụ ochie n'ọnụ nke ọhụrụ. Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren gwara ụlọakụkọ Punch na ha nwụchiri nwa amadi a n'ezie ma kwukwaa na a nwụchiri ya na ngwụcha izuụka. N'akụkọ yiri ibe ya, EFCC nwụchikwara onye chịburu Plateau steeti n'oge gara aga bụ Jonah Jang, maka ego ha sị na o mefuru oge ọ nọ n'okwa ọchịchị nke ruru ijeri naira iri. Akụkọ ga-amasị gị:" media-52045298,https://www.bbc.com/igbo/media-52045298,Self Isolation: Uru na ọghọm dị na mmadụ isi n'ụlọ arụ ọrụ,Ọrịa coronavirus emeela ka emechie ọtụtụ ụlọọrụ ma nke gọọmentị ma nke ndị nkịtị.,"Ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ nọzị n'ụlọ wee na-arụ ọrụ. Mana ọdịchaghị mfe ịnọ n'ụlọ arụ ọrụ n'ihi ihe nhịahụ dị icheiche dịka ọkụ latrik, ịntaneetị, na ndị ọzọ. BBC Igbo na ụmụada Igbo abụọ nwere mkparịtaụka, ha wee kọọrọ anyị etu ọrụ ha si aga ugbua ha nọ n'ụlọ. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-53370800,https://www.bbc.com/igbo/media-53370800,Coronavirus: 'Mmadụ 30 ga-anwụ tupu m kweta na ọrịa a dị na Naịjirịa',"Site n'ime ụlọọgwụ pụrụiche maka ọgwụgwọ ndị bu ọrịa a rue n'okporoụzọ, echiche ndị mmadụ dị iche.",Ụfọdụ dịka ndị na-agwọ ndị bu ọrịa na-akwa arịrị maka etu ndị mmadụ si anwụ n'aka ọrịa. N'aka nke ọzọ ndị mmadụ agbara ajụjụ ọnụ n'okporoụzọ na-ekwu na ọrịa ahụ adịghị ya chaachaa. Lee okwu ha n'uju ebe a: afirika-48725192,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48725192,Olisa Metu's claims over N400m: Jonathan atụpụghị ọnụ,Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ajụla ịtụpụ ọnụ n' okwu Olisa Metu kwuru na ọ bụ ya nyere ya nde naira 400 a na ebo ya na o zuru.,"Goodluck Ebere Jonathan Olisa Metu bụ onye rụbụrụ ọrụ dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi nke ndị 'Peoples Democratic Party'. Olisa Metu Olisa Metu kwuru na ọ bụ mgbe ya na Goodluck Jonathan nwere mkparịtaụka ka o nyere ya ego ahụ. O kwukwara na ya bụ ego bụ maka iru ọrụ maka oganiru nke Naịjirịa. Mgbe BBC kpọrọ Ikechukwu Eze onye bụ ọnụ na-ekwuchitere Jonathan, o kwuru na o nweghị ihe ha nwere ikwu n'ihi na okwu a ka nọ n'ụloikpe. Chetakwa na Gọọmentị na-ekwu na ọ bụ Sambo Dasuki (rtd) nyere Olisa Metu ya bụ egọ, mana Olisa Metu kwuru na ebubo ahu abughị eziokwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48793743,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48793743,Ndidi Vs Kante: Ihe ndị egwu bọọlụ a ji ewu na soshal midia,Nwafọ Naijiria na-agbara Leicester City Bọọlụ bụ Wilfred Ndidi aghọọla okwu a kpụ n'ọnụ ka a kpọpụtachara ya dịka onye kara chakee na asọmpị Naijiria na mba Burundi n'izu gara aga.,Ị ga-eji Ngolo Kante na Wilfred Ndidi Ọ chakekwara oge Naijiria zutere mba Guinea n'ụbọchị Wenezdee. Ọ bụ nchake ahụ kpalitere mụọ ụfọdụ ụmụ Naijiria ha were bido iji Ndidi tụnyere Kante bu onye mba France na-agbakwara ndị otu egwu bọọlụ Chelsea nke Ịngland. Okwu ahụ bidoro ndọrịtaụka pụrụ ọkụ. Ụfọdụ kwuru na Ndidi bụ egwu e ji n'ime ndị na-agba etiti. @realoladele kwuru na Ndidi ka Kante mma. @QdPaper kwuru na Ndidi ka mma mana ihe mere bụ na o nweghị ndị na-egburu ya opi Ụfọdụ kwuru na o nweghị ka ọdụ egbe na ogene siri yie. @josagana sị na ọ bụ mkpalị nye Kante iji Ndidi tụnyere ya. @blacky kwuru na iji Ndidi tụnyere Kante gosiri na ụmụ Naijiria ka n'isi ma kwesị ka ndị ọcha chịa ha ọzọ. @Qwarmie_J kwuru na ya bụ okwu bụ okwu ndị amaghị nke a na-akọ. Akụkọ ga-amasị gi: afirika-44815104,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44815104,Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Dangote na-achọ nwunye ọzọ.,Akụkọ ndị dị mkpa Ị ga-alụ Dangote?,"End of Twitter post, 1 End of Twitter post, 2 Aliko Dangote ekwuola na ọ dị njikere ịlụ nwaanyị ọzọ. Nke a mere na ụmụnwaanyị dị iche iche na-arịọ ya ka ọ lụọ ha. Gịnị bụ uche gị? Ndị mmadụ na-eṅomi Fayose Soshal midia ewurula ọkụ dịka ndị mmadụ n'eṅomi aka na-achị Ekiti steeti Ayodele Fayose maka ahụ ọ merụrụ ụnyaahụ. N'ọwụwa anyanwụ, Otu nwata akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa na Nsukka bụ Chidozie Okonkwo ebola ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ ebubo na ha nyere ya ọgwụ driipu mebiri emebi. Ụlọọgwụ ahụ ekwetala na ha nyere ya ya bụ ọgwụ eziokwu ma rịọ ya na ụmụnwanne ya mgbaghara. Ben Murray-Bruce na Buhari Sinetọ na-anọchite anya Bayelsa East bụ Ben Murray-Bruce akatọla okwu Buhari kwuru na ọ bụ nkwa o kwere ndị Naịjirịa ka ọ na-emezu mgbe ọ gbaghere ọdọ ụgbọ oloko nke Abuja taa. Murray-Bruce kwuru na ọ bụ gọọmentị ndị ọzọ gara aga malitere ọrụ a ma fodụ obere ị rụcha ya. Na mba ofesi, Donald Trump ekwuola na ngagharị iwe ndị mba Briten na-eme gbaasara nleta ya emetụtaghị n'uche. Ya na nwunye ya bụ Melania Trump gara njem mba Briten maka nleta ọrụ ga-eru abali abụọ. N'egwuregwu, N'akụkọ mere ugbua, otu egwuregwu Premier Lig bụ Chelsea akwadola ị kwuputa ọpụpụ onye nchịkọta ha bụ Antonio Conte. Dịka ọ dị ugbua, ha ekwubeghi ihe o ji apụ maọbụ onye ga-anọchị anya ya. Gee nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45742572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45742572,"Nnamani, Egwu enwetala ikike ịga sineti n'aha pati ha","Chimaraoke Nnamani ji vootu 583 were merie n'ịzọ ọkwa onye ga-anọchite Enugu East zone n'ụlọoimeiwu ebe Chinedu Nnewi ,onye nwetara vootu 80 nakwa Nkwuo Ngene onye nwetara vootu 70 na ntuliaka ndị PDP mere n'Enugwu steeti.","Chimaraoke Nnamani na Sam Egwu chịburu dịka gọvanọ Enugu nakwa Ebonyi steeti Sam Egwu bụ naanị onye zọrọ ọkwa ịnọchite Ebonyi-North na Sineti n'aha PDP na ntuliaka imeụlọ ha mere n'Ebonyi steeti. Aka chịburu Abia bụ Theodore Orji nwetakwara ikike ịnọchite Abia-Sentralụ ọzọ na ntuliaka imeụlọ PDP mere n' Umuahia, ebe Enyinnaya Abaribe, na Mao Ohuabunwa nwetakwara nke Abia South nakwa Abia-North na ntuliaka imeụlọ PDP mere Aba na Ohafia. N'aka nke ọzọ, aka na-achị Nasarawa steeti bụ Umaru Al-Makura nwetara ikike otu APC ịnọchite Nasarawa- South na sineti n'afọ 2019. George Akume, onye bụbu gọvanọ Benue nwetakwara ikike APC ịzọ ọkwa ịnochite Benue North-West n'ụlọomeiwu ukwu. O nweghị onye ya na Akume onye garala ije ugboro anọ zọrọ ọkwa ahụ. Ọ na-achọ ịghọ omenala na ndị biburu Gọvanọ na-aga ụlọomeiwu ụkwu ezumike nka. Cheta na Rabiu Kwakwanso sinetọ na-anochite Kano-Sentralụ bụbu gọvanọ Kano steeti, Godswill Akpabio bụbu Gọvanọ Akwa-Ibom, ebe Bukola Saraki bụbụ gọvanọ Kwara steeti.. Akụkọ ga-amasị gị:" media-45180261,https://www.bbc.com/igbo/media-45180261,Lee ndị akpụpụrụ ụlọikpe maka Saraki,Ndị kpuru isi emeela ngagharị iwe n'Imo,"Ha ekpeela DSS, ndị uweojii, Sineet na ọkaiwu ukwu Naịjirịa n'ụlọikpe maka Saraki Ndị omeiwu ukwu abụọ aha ha bụ Rafiu Adebayo na Isa Misau akpụpụla ọkaiwu ukwu Naịjirịa, ndị uweoji, DSS, Sineet na mmadụ asaa ndị ọzọ maka ị kwụsị echiche ọbụla gbasara ị chụda Saraki dịka onyeisi ndị omeiwu ukwu. N'Imo steeti, ndị kpuru isi na-agụ akwụkwọ na Mahadum nakwa ndị otu ha gwụchasịrị akwụkwọ Mahadum mere nghagharị iwe n'Owere n'ihu ụlọọrụ ọchịchị gọọmentị. Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ego gbata gbata ha dịka e kwere ha na nkwa. Soumaila Cisse na-akwado mgba Na mba Mali, onye na-azọ ọkwa dịka onyeisiala n'ime paati nke na-anọghị n'ọchịchị bụ Soumaila Cisse ekwuola na ya agaghị anabata mkpebi kwuru na Ibrahim Boubacar Keïta bụ onyeisiala Mali bụ onye meri na ntuliaka ala ahụ. Ugbua, Cisse na-akpọ ndị na-akwado ya ka ha bido nghagharị iwe ngwa ngwa. Samuel Eto agaala Qatar Akụkọ n'ekwu na Samuel Eto ga-aba otu egwuregwu Qatar SC na-efu. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego" afirika-51000889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51000889,UBA Sack: Ọchụchụ anyị biara na mberede - Onye ọrụ UBA,"""Ọ bụ mgbe m rụchara ọrụ n'ụbochi Fraide ka a kpọrọ anyị were sị anyị dee akwụkwọ arụkwaghị m"" etu, otu Josephu Agumadu( ọ bụghị ezi aha ya) onye ụlọọrụ 'United Bank for Africa' (UBA) a chụrụ n'ọrụ na nso nso siri nata ozi na a chụọla ha n'ọrụ.","Agumadu, onye gbara BBC Igbo ama na ya arụọla ọrụ n'ụlọakụ afọ iri na abụọ dịka onye na-ata ego (teller) so na mmadụ puku anọ ụlọakụ UBA churu n'ọrụ n'afọ ọhụrụ a. Mana kama ikwu maka ndị ha chụrụ n'ọrụ, ụlọakụ UBA na-akụ ekwe mmadụ 4000 ha were n'ọrụ n'akara igwe okwu Twitter ha: End of Twitter post, 1 Nwoke , onye gbara ama na ya ji asambodo 'OND' banye n'ọrụ ahụ ma mechara nweta B.Sc kwuru na ""ọtụtụ ndị a chụrụ n'ọrụ bụ ndị 'Teller'"". ""Anyị dịbu 'teller' atọ, a kpọtara ndị teller ọhụrụ atọ kemgbe ọgw ụgwụ afọ ha soro anyị na-arụkọ. Nwoke ahụ onye kwuru na ya bidoro nyowa agwa a na-akpaso ha dịka e wetara ndị ọhụrụ n'ọgwụgwụ 2019 ma gbaa mbọ ịhụ na ha kuziere ha ọrụ tupu af ọ gara aga agwụ. ""Onyeisi nlekọta anyị na-ekwukarị 'bido n'ọnwa Janụwarị."" ""Ọ bụ ka ihe mere ka anyị matara nebunobi ha bụ iji ndị a anyị kuziri ọrụ dochie anyị."" Dịka ọchụchụ n'ọrụ metụtara ọtụtụ ndịọrụ nọ n'alaka UBA dị n'akụkụ Naijiria dị iche iche, ụlọakụ ahụ buliri ụfọdụ dị mmadụ n'ọkwa, ebe ha tinyere ego n'ụgwọọnwa . Agumadu kwuru na ha kwụrụ ya ụgwọ ọnwa isii dịka ego laba ezumike mana ọchụchụ n'ọrụ a dara ya na mberede mere Naijiria dị ya ka Ghana. Ọ gwara BBC sị, ""Ka o dị ụgbụ a, amaghịzị m ihe ọzọ m ga-eme"". Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" egwuregwu-47846811,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47846811,Everton vs Arsenal: Arsenal anarala ọgwụgwọ nsọ n'aka Everton,Otu egwuregwu Everton jiri otu ọkpụ goolu merie Arsenal mgbe ha zutere onwe ha taa.,Ọ bụ Phil Jagielka nyere goolu a n'ime nkeji iri na agba nke mbụ na asọmpị ahụ. Otu Arsenal nwara ike ha mana ha asatanwughi ọkpụ goolu ahụ kama otu. Mezut Ozil na Alex Iwobi so na ndị pụtara ịgba asọmpị a n'otu Arsenal. Mmeri a Arsenal natara n'aka Everton mere na ha nọ n'ọnọdụ nke anọ na tebulu Premier Lig. afirika-52715621,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52715621,Palm Oil: 'Eji m ịsụ mkpụrụakwụ na mmanụ nri zụọ ezinaụlọ m',"Ezinma Ogbonna, bụ nwaanyị na-arụ ọrụ ubi nke gụnyere isụ mmanụ nri gwara BBC Igbo etu ya na di ya si zụọ ụmụ ha n'ogogo dị elu site n'ịsụ mmadụ nri a.",Ọ sị na ọ malitere orụ ubi kamgbe ọ lụrụ di rute ugbua ma kọwakwaa usoro ọ ji emepụta mmanụ nri a nakwa uru mmanụ nri bara n'ala Igbo. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ site n'ịsụ nkwụ a ka ha ji rụta ụlọ ha. Kirie ihe o kwuru n'uju; Ndị mere ihe akụkọ a: Ikechukwu Kalu na Chiemela Peter Akụkọ ndị ga-amasị gị: media-48327469,https://www.bbc.com/igbo/media-48327469,Nollywood Language: 'Ihe nkiri Igbo ga-abụ egwu eji site na ntuziaka m na-eweta' - Ikeagwu,Ị mana ihe nkiri Igbo na-amasị ọtụtụ mmadụ?,Kalu Ikeagwu na-eme ihe nkiri bekee kwuru na ọ na-agba mbọ ị hụ na ihe nkiri Igbo ga-abụ elelebe eje ọrụ ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-55289537,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55289537,Eastern Security Network bụ atụmatụ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ Nnamdi Kanu na Ipob zuuru-,Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti eboola onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ebubo izuru atụmatụ ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ na-ahazi maka nchekwa ala Igbo.,"Uzodinma , onye kwuru nke n'abalị Fraide dịka ya na ndị ntaakụkọ na-akparịta ụka n'Owere kwuru na ndị gọvanọ ekwekọrịtala ma na-ahazi etu ha ga-esi mee ya bụ otu maka nchekwa Ọwụwa Anyanwụ, tupu Kanu weghara aha ""Eastern Security Network."" Ọ gara n'ihu boo otu Ipob ebubo iji otu Eastern Security Network ebute ọgbaghara n'Alaigbo. "" Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ gbaliri ihiwe, ""Eastern Security Network"" site na njikọ aka otu Ohaneze Ndigbo."" ""Ndị Ọkaiwu steeti dị na steeti ewepụtara akwụkwọ maka atụmatụa, tupu anyị mara ihe na-eme, Ipob zuru aha ahụ ma were ya bido na-eme mpụ."" Uzodinma gara n'ihu kwuo na ha ka na-elebanye anya n' iwepụta otu nchekwa ga-atọ atọ dịka ndị gọvanọ ga-ezuko n'Owere n'izu ole na ole na-abịa ịtụ alo maka nchekwa obodo n'Ọwụwa Anyanwụ. A kpọrọ ya ESN maọbụ Amọtekun, ha niile bụ maka nchekwa onwe - Enyinnaya Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia South n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu banyere nhiwe Eastern Security Network. Abaribe tinyere ọnụ ya mgbe ọ na-aza ajụjụ n'emume Focus nke ụlọ ntaakụkọ AIT n'ụbọchị Mọnde. N'okwu ya ""Ọ bụ naanị osisi ga-akwụrụ ka mmadụ were mma bịa gbuo ya"". Ọ sị iwu mbụ ị dịrị mmadụ n'ụwa bụ iwu ichekwa onwe ya, na a agaghị ewepụ ya ewepụ. Ọ sị na ị agaghị achọ ịnwụ ebe ị na-eche ka otu nchekwa iwu kwadoro dịka uweojii, ndịagha bịara bịa zọpụta. ""Ndị mmadụ nwere ikike ichekwa onwe ha dịka iwu nchekwa onwe siri kwuo, ọ bụrụ n'aha AMOTEKUN maọbụ ESN"". ""Iwu Naịjirịa sị na i nwere ikike ịdị ndụ, o nweghi onye ga-anara gị ya ebe ị na-eche ka ndị nchekwa na-anaghị arụ ọrụ ha bịa chekwaa gị."" Ọ gara n'ihu sị na ọ ga-ajụta ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ma ha ọ ga-akwado Eastern Security Network n'ụzọ iwu. Ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ sara Elliot Uko maka ESN Nnamdi Kanu hibere Ụfọdụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu ekwuola na o nweghị ihe ha ga-asa onye chọpụtara Igbo Youth Movement, Elliot Ugochukwu-Uko maka ụta o buyere ha gbasara Nnamdi kanu hibere Eastern Security Network. Don Adinuba bụ kọmịshọna mgbasozi gọọmenti Anambra steeti ugbua kwuru na o nweghị ihe ọ ga-asa ndị na-eme nkọgherị. Kọmịshọna mgbasaozi nke Imo na Ebonyi steeti azaghị ekwenti ha maọbụ ozi anyị zigara ha ruo ugbua. Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ gọọmenti Enugu na Abia steeti. Ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwurụla maka nchekwa n'ala Igbo N'afọ 2019, ka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu kwekọrịtara ihibe kọmiti ga-elebe anya n'ọrụ nchekwa iji ihibe otu ndị nche ọrụ ha bụ ilekọta ndị nche n'ime ọhịa na ụzọ niile dị n'ọwụwa-anyawụ gbaa gburugburu. Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ machịkwara ịchị ehi agagharị na mpaghara ha n'otu afọ ahụ(2019) Chetakwa na otu jikọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ mechara hibe otu nche a n'abalị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2019. Mana emechara ụfọdụ ndị nọ na kọmịtị ahụ, onye dịka ọkammụta Uzoma Nwali gbara arụkwaghịm ma kwuo na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ anaghị ege ụmụ Igbo ntị kama ha na-eme ihe dị ha mma. Onye ma ma ọ ihe niile a mere ndị mmadụ ji hibee otu nchekwa nke ha? Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN' Onyeisi otu IYM bụ Elliot Ugochukwu Ukoh kwuburu na ọ bụ ndị Gọvanọ mere ka otu dị ka Eastern Security Network selite isi. O kwuru na ọ bụrụ na ndị Gọvanọ gere ntị na ndụmọdụ ya ịkpọkete ndị ntorobịa nso, ihe agaghị eru etu a. Cheta na onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ Eastern Security Network maka nchekwa mpaghara ala Igbo. ""Anyị akwadoghi mba ọgụ Nnamdi Kanu na-abara ndị gọvanọ"" Ụfọdụ otu si Ọwụwanyanwụ ejikọtala aka ọnụ katọọ mba ọgụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ maka ịjụ inye otu 'Eastern Security Network' nkwado. Ha kwuru na Kanu ịnọ na mba ofesi na-achịkọta otu ahụ gosiri na o nwere ihe ọzọ o bu n'obi na abụghị ọdịmma ha. Otu Ipob nna-ebo ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu ebubo ịlakanyere ha ndị agha Naijiria n'ihi nhiwe onye ndu ha bụ Kanu hiwere otu nche 'Eastern Security Network' n'Ọwụwa Anyanwụ. N'ozi ha wepụtara nke ndị isi ha gụnyere: Ọkaiwu Uche Ude(Ndigbo Progressive Youth Vanguard), Andy Okoro(South East Youth Network) na Deaconess Grace Ejike(South East Market Women Vanguard) binyere aka, ha kwuru na ""Nnamdi Kanu agaghị ekwuru ndị Igbo na Naijiria maọbụ ebe ọbụla n'ihi na ọ bụghị onye ndị mmadụ họpụtara ya ịnọchite ha dịka iwu Naijiria si kwuo. ""Ya lọta bịa mee ntuliaka ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ikwuru ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka iwu Naijiria si dị. E wepụ nke a , o nweghịkwa ihe ọzọ."" Ha jara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ike maka iji iwu achịkọta obodo ma kpokuo ndị ntorobia ka ha wepụ aka n'agwa ọbụla ga-esosi ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị chọrọ ikposaa Naijiria, ọkachasị ugbua mpaghara dị iche iche na-akpọ oku ka enye ndị Igbo ohere ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Na nkọwa ha, nkwado ndị mpaghara ndọị ọzọ dị mkpa maka Ọwụwa Anyanwụ inweta ọkwa ahụ. Eastern Security Network pụtara maka na ndị gọvanọ dara n'ọrụ nchekwa ha - Charly Boy Eastern Security Network pụtara maka na ndị gọvanọ dara n'ọrụ nchekwa ha Ndị ọnụ na-eru n'okwu gbakọrọ kwuo maka Eastern Security Network nke Nnamdị Kanu hibere. Ndị a gunyere Charly Boy, Ozioma Izuora onye ọka iwu, Fredrick Nwabufo onye ntaakụkọ. Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ akatọọla nhiwe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob hiwere otu nche 'Eastern Security Network'. Onyeisi otu jikoro ndịị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ bụ Dave Umahi gwara ndị ntaakụkọ n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Fraide na mpaghara Ọwuwa Anyanwụ bụ ebe kachasị nwe udo, na enweghị nsogbu nchekwa. Ụmahi sịrị, "" Achọrọ m ịgba ndị be anyị ume na mgpaghara anyị bụ ebe udo kachasị achị, o nweghị onye ga-agbagha nke a."" ""Ya mere mgbe nwanne anyị nwoke si na ya ewetala otu nche n'Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụ ihe ịkpa ọchị nke ekwesịị ịgba nkịtị kpamkpam."" Ọ gara n'ihu too ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ maka ""mbọ ha na-echekwa mmadụ na akụnaụba na mpaghara ahụ na-agbanyeghị nkatọ a na-akatọ ha."" Umahi kpọkwara oku ka a ghara ịchụ ndị isi ọchịagha Naijiria ka nsogbu ghara isi na ya dapụta. Etu nhibe Eastern Security Network na Amotekun siri dị iche Ndị otu Amotekun na ndị otu 'Eastern Security Network' Dịka akụkọ nakwa ihe onyonyo pụtara na soshal midia si gosi, otu nchekwa a kpọrọ 'Eastern Security Network' dị ka ha amalitela ọrụ n'uju na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Otu a nke onye hibere ya bụ Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra', bụzị okwu a kpụ n'ọnụ n'ala Igbo ugbua. Imirikiti ndị welitere isi n'ala Igbo kwadoro otu ESN, mana ụfọdụ na-ekwu na ọ dabaghị. Ndị kwadoro ya kwuru na ọ yitere otu nchekwa nke dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ a kpọrọ Amotekun, maọbụ otu nchekwa nke a kpọrọ Hisbah, na mpaghara Ugwu Naịjirịa.. Ihe Charly Boy kwuru gbasara otu nchekwa ESN Otu n'ime ndị a bụ onye otiegwu a ma ama bụ Charles Oputa (Charly Boy) Kedụ myiri dị na Amotekun na ESN? Nnamdi Kanu (hibere otu ESN) na Rotimi Akeredolu (Otu n'ime gọvanọ isii na mpaghara Ọdịda Anyanwụ hibere otu Amotekun) Ndịiche dị na Amotekun na ESN Gọvanọ Ondo Steeti bụ Rotimi Akeredolu yi uwe Amotekun iji gosi nkwado ya Eastern Security Network agbasoghị iwu Naịjirịa - Ndị ọkaiwu Dịka okwu gbasara atụmatụ 'Eastern Security Network' na-ebiri ọkụ, ndị ọkaiwu abụọ etinyela ọnụ n'okwu ahụ. Otu n'ime ha bụ Anthony Okah gwara BBC Igbo n'ekwentị na atụmatụ ahụ megidere iwu nchekwa Naịjirịa. Okah sị, ""Iwu Naịjirịa megidere mmadụ ịbu egbe n'enweghi ikike ibu ya."" O kwukwara na ebe Ipob bụ otu gọọmentị etiti machiri amachi, ọ ga-eso na ọgbakọ na atụmatụ niile ha tụrụ bụ nke a machiri amachi. Onye ọzọ bụ Uche Maduemesi kwụnyeere ibe ya bụ Anthony Okah n'ikwu na ọ dara iwu. N'ọnụ ya ""ha kwesiri ị nata ikike n'ihi na ọ bụghi onye nọkata bilie ọ sị na ọ na-echekwa obodo"". ""A na-ede akwụkwọ, gọọmentị enye ha ikike tupu ha amalite ọrụ"". Maduemesi kwukwara na ọ dị mma na Kanu hibere ya bụ otu mana o kwesiri ekwesi ka ha denye aha ma nata ikike n'aka gọọmentị. Etu 'Eastern Security Network' ga-esi rụ ọrụ Ọkaiwu Aloy Ejimakor bụ onye ọkaiwu otu IPOB nakwa Nnamdi Kanu kọwara na akụkụ 59 n'iwu Naịjirịa akpọrọ 'Penal Code' metụtara nhibe otu nchekwa ahụ. Ejimakor kọwara na otu ahụ ga na-arụ ọrụ dịka ndị ọrụ nche nke ime obodo a kpọrọ 'Vigilante' na Bekee. Ọ sị, ""Ha abụghị 'Biafra Army', ha anaghị emegide gọọmentị Naịjirịa. Ha bụ maka nchekwa mpaghara ala Igbo"". N'ọnụ ya 'Ha anaghị egbu mmadụ, ihe ha na-agwa Igbo bụ ""keenụ nkwụcha na nkwụcha abụghị ụjọ""'. 'Anyị kwadoro atụmatụ Eastern Security Network maọbụrụ na...' - Ohaneze Ndịgbo Emeka Attama bụ ọnụ na-ekwuchitere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha kwụnyere Nnamdi Kanu maka atụmatụ nchekwa o weputara. Ọ gwara BBC nke a na mkparịtaụka ekwentị ebe o kwuru na Eastern Security Network dị mkpa maka ịnye ndị Igbo olileanya na nchekwa dịịrị ha. O kwuru na o nweghi ihe dị njọ ma ndị Igbo nwee nke ha ebe mpaghara ndị ọzọ nwere nke ha. ""Anyị ga na-akwado ya bụ atụmatụ maọbụrụ na ejighi ya megbuo ndị ọzọ, ọ kachasị ndị abụghị ndị Igbo"" ka o kwuru. Mana o kwukwara na ihe wutere ha bụ na Nnamdi Kanu agwaghị ha tupu o hibe ụdịrị ihe dị etu ahụ. Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ụmụntoroọbịa so na 'Eastern Security Network' na nnukwu nsogbu- Ralph Uwazuruike 'Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ndị otu 'Eastern Security Network' na nnukwu nsogbu' Onyeisi otu aha ya bụ Movement for the Actualisation of the Soverign State of Biafra, MASSOB bụ Ralph Uwazuruike ekwuola na Nnamdi Kanu na-etinye ndụ ụmụntoroọbịa ọ hụpụtara maka Eastern Security Network na nnukwu nsogbu. O kwuru na onweghị ebe ya bụ otu nchekwa ji azụ eje maọbụrụ na aka ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ adịghị ya. Uwazuruike kwuru na onye ọbụla kwesiri ịkatọ atụmaatụ a Kanu ji pụta ugbua. Lee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a. Ihe ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ kwuru maka otu ndị nchekwa Nnamdi Kanu si na o hibere Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ etinyela ọnụ n'okwu Nnamdi Kanu kwuputere na o hibela otu nchekwa ọhụrụ n'ọwụwa anyanwụ. Kọmishọna mgbasaozi gọvanọ Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na Anambra bụ steeti kachasị nwe ezi nchekwa. Ma na-ekwu na ndị mmadụ kwesiri ịbịa mụta ka esi echekwa obodo n'aka ha. N'okwu ya, ""Anyị ga-akụziri ndị mmadụ ka esi echekwa obodo ọbụghị ndị mmadụ ga-akụziri anyị"" Kọmishọna mgbasaozi nke gọvanọ Abia steeti bụ John Okiyi Kalu kwuru na ha agaghị etinye ọnụ n'okwu ahụ. Ebe ndị nke Imo, Ebonyi, Enugu azabeghị anyị. Nnamdi Kanu sị na o hibela otu ndị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Nnamdi Kanu bụ onyendu otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), ekwuola na ya ehiwela otu nchekwa a kpọrọ Eastern Security Network (ESN), bụ nke ọ sị ga-egbochi mkpamkpa ndị ọchị ehi. O kwuru na e hibere otu a n'ihi na ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ ndị ụjọ, na ha enweghi ike ime ụdịrị ihe ndị na-achị mpaghara ndịda Naịjiria mere dịka ha hibere otu nchekwa nke ha a kpọrọ Amotekun. Kanu kwuru na nhibe a dị mkpa n'ihi na ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ anaghị aganwuzi ugbo n'ala Igbo n'ihi ụjọ mwakpo, ma kwuo na ebe ọbụla e gburu ndị Biafra, na ndị gọvanọ na ndị kọmishọna uweojii ga-eji isi buru ya. O kwuru sị ""Ụfọdụ ndị nwereike ikwu na Amotekun nwere iwu na-achị ha, mana achọrọ m ime ka o doo onye ọbụla anya na agwọ nọ n'akịrịka n'ala anyị, nke bụ na anyị agaghị esi ụzọ ahụ."" ""Aga m ewepụta ihe onyonyo ka ị hụ na ọ bụghị egwu ka anyị na-egwu."" Ọ gara n'ihu kwuo ""anyị ekpebiela na anyị agaghị ekpesara onye ọbụla ọzọ"". N'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ n'Oyigbo dị na Rivas steeti n'ọnwa Ọktoba, Kanu kwuru sị na ndị ọbụla aka ha dị na ya bụ ogbugbu agaghị alafere. O kwukwara na ọ dịka ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court (ICC) na ndị ọzọ agbachiri nkịtị ""ka a na-egbufusi ndị na-enweghi ihe ha mere"", ma kwuo ""anyị agaghị ekwe ka a na-egbufusi ndị mmadụ etu ọ masịrị ndị ọchịchị steeti. Ana m eme ka ngalaba United Nations mara ugbua a na o mee ọzọ, anyị ga-emegwara."" O kwuru sị ""wepụtanụ ihe niile m na-ekwu ma zigara ya ndị ICC. Achọrọ m ịga ụlọikpe ahụ..."" 'Ndị mmadụ ga-apụta mee ngagharịiwe' Kanu kwukwara na n'ime izu ole na ole na-abịa, ndị mmadụ ga-apụta ime ngagharịiwe, ọ sị na ndị ESN ga-apụta ichekwa ha. O boro ndị agha ebubo na ha gburu nne na nna ya, ma kwuo na ""ha (ndị nkwado ya) apụtala ịnwụ maka nkwenye ha"". ""Ndị be anyị adịla njikere ịlụ ọgụ, ọ bụghị ọgụ nnwereonwe n'aka Naịjiria - anyị ga-esi n'aka 'referendum' nweta nke ahụ - mana ọ bụ ọgụ ichekwa obodo anyị. Anyị chọrọ ka ndị nne anyị gaa ọrụ ugbo na-atụghị ụjọ mwakpo n'ike."" Gịnị bụ 'Eastern Security Network'? Kanu kwuru na Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra, na ha bụ ndị nchekwa. ""Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra. Ọ dị ka Amotekun. Mgbe oge ruru anyị ga-egosi ụwa ndị agha Biafra."" ""Anyị anaghị abanye agha ọbụla."" Mara na gọọmenti Naịjirịa gụnyere Ipob n'ime otu ndị na-eyi ndụ egwu na mba ahụ. Ha sikwa na ha bụ ndị enweghị ikike ịgbakọ. Ọ bụ ndị omeiwu steeti na ndị gọvanọ nwere ikike ihibe ndị ọrụ nchekwa na steeti dị iche iche na Naijiria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56619283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56619283,Leohand Lyeanyi: Etu nwunye ya si eri uju ọnwụ ya,"Nneka Onyia bụ nwunye Leohand Lyeanyi Onyia, onye a na-ache na ndị uweojii India gburu akwaala arịrị ma kọwaa etu ọnwụ di si emetụta ya.","Ọ gwara BBC Igbo etu o si na ọ bụ di ya na-akpọte ya n'ụra kwa ụtụtụ ọbụla mana kamgbe ọ nwụrụ nke ahụ adịghị emezikwa. Nneka sị na ya na di ya kwuru okwu n'ekwentị n'abalị Satọde mana ozi ọzọ o nwetere bụ na di dọzi n'ozu na mba India. Mgbe ọ jụrụ kedụ ka ihe si mee, a gwara ya na ọ bụ ndị uweojii ji ihe kugbuo ya. Kirie ihe o kwuru n'uju." afirika-45617688,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45617688,Osun Election: A na-akwazị mgbọ n' Oshogbo,"Ka ndị Oshun steeti na-akwado mmegharị ntuliaka na ọdụ vootu ise nke a ga-eji mara onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ, ndị a na-eche na ha bụ ndị otimkpu ndị ndọrọndọrọ na ndị uweojii kwakọrọ mgbọ ụnyaahụ na mpaghara Alekuwodo nke dị n'Oshogbo.","Ụgbọala Fatai Diekola bụ otu ndi isi PDP n'Oshogbo Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere na mgbọ tụrụ mmadụ atọ, nke otu onye n'ime ha bụ nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ. Onye ntaakụkọ BBC nọ n'obodo ahụ kwuru na akwamgbọ a mere, ma kwukwa na ya hụrụ mgbe ndị uweojii bịara kpụpụ ụgbọala otu onye isi ya gbagotere na PDP nke Oshun steeti aha ya bụ Fatai Diekola. Nke bụ n'azụ ka ndị isi aba okpu mebiri ya bụ ụgbọala. Premium Times dere na nwanne nwatakiri a mgbo tụrụ gwara ha na ọ bụ n'ihu ebe ha na ere ahịa ka mgbọ bịkwụrụ nwa ada ahụ. Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ọgbaghara a bidoro na ehihe ụnyaahụ mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị na-akwado PDP na ndị nke APC nwere nsogbu. O kwukwara na obodo ahụ dị juu n'ụtụtụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-54286170,https://www.bbc.com/igbo/media-54286170,"Atụmatụ nọrọ n'ụlọ Ipob weputara chịtara ọkụ na Nnewi, Ọnịcha na Aba ma gbaa ọnyụpa n'ebe ndị ọzọ","N'agbanyeghị oku 'nọrọ n'ụlọ' nke otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob kpọrọ, ahịa zụrụ n'Enugwu dịka ọ na-azụ, ebe ahịa na ahịa na Nnewi, Ọnịcha na Aba tọgbọrọ chakoo.","Otu Ipob kpọburu oku ka ndị na-eso ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị mbụ nke Oktoba Naịjirịa na-eme mmemme ncheta afọ iri isii e jiri nweta nnwereonwe mba ahụ. Mana ọtụtụ ndị na-azụ ahịa n'Abakaliki nakwa n'Enugwu na-ekwu na obi adịghị mma ka ihe si aga na Naijiria gwara ndị ntaAkụkọ BBC na agụụ so n'ihe mere ha ejighi sonyere ndị Ipob n'oku ha kpọrọ. Etu ụbọchị ahụ siri gaa n'Enugwu Ahịa Ogbete na-ekwo ụbọchị Oktoba 1 etu o sibu ekwo Onye ntakụkọ anyị gara Ahịa Ogbete Enugwu kwuru na ndị mmadụ na-azụ ma na-ere, ebe ụgbọala na-agbakwa ọfụma. Na agbanyeghị na mmiri zoro n'ụtụtụ tata, ebe niile na-ekwo ekwo ka o si adị na mbụ. Mmọnwụ gbara na 'Coal Camp' Onye nta akụkọ BBC gagharịrị Enugwu kwuru na ụgbọala njem na-agba dịka ahịa na-azụ. Ndị agha Naịjirịa na ndị uweojii nọkwa n'ụzọ na-echekwa. Mmọnwụ gbara na ""Coal Camp dịka ndị bi na mpaghara ahụ na-emerụba ụbọchị Emume Nnwereonwe Naijiria. Ụgbọala ndị uweojii na nke ndị agha nọcha na New Heavean Junction dị n'Enugwu ụbọchị mbụ nke ọnwa Oktoba, afọ 2020 Etu ndị Nnewi na Ọnịcha siri mee n'ụbọchị ahụ N'aka nke ọzọ, ndị bi na Nnewi gwara BBC Igbo na ha n'ụlọ n'ihi ntụzịaka otu Ipob. Naanị ndị ọkada bụ ndị a hụrụ n'Okporoụzọ 'Bank Road' na-ekwokarị ekwo Ọdọahịa ndị mmadụ kpochichara akpọchi na Nkwo Nnewi. Ebe Bank Road bu na-ekwokarị ekwo bụ nanị ndị ọkada mmadụ ole na ole na ndị ahịa mbuharị ka a hụrụ. Ahịa azụghị na Nnewi. Naanị ndị ọkada na ndị ahịa mbugharị ka a hụrụ na Nwaanyị Imo Bus-Stop Nke dị ka ibe ya bụ na ahịa azụghị n'Ọnicha, ebe ndị mmadụ nọ n'ụlọ ha. Otu onye bi n'Ọnicha achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na e tiri ndị gbapere ọdọahịa n'ogbe n'isi ụtụtụ ihe. Okporụzọ tọgbọ chakoo n'Ọnicha Anambara steeti maka nọrọ n'ụlọ ipob kpọrọ Ahịa zụrụ n'Ọka mana ọdọ ụgbọala tọgbọ chakoo Ndị mmadụ na-akpagharị , ebe ahịa kworo ekwo n'Ọka, isiobodo Anambara steeti. O nweghị emume pụrụ iche gọọmenti mere iji cheta afọ iri isii Naijiria nwetara Nwereonwe. Onye ntaakụkọ anyị gara n'ama' Dr Alex Ekwueme Square' dị n'Ọka kwuru na m̀kpatụ a na-emekarị nakwa ejiji a na-ejichi ama ahụ adịghị ya. Kama e ji igodo gbachie ọnụụzọ ama ahụ. Mmadụ na ụgbọala kọrọ ụkọ n'okporoụzọ dị nso n'ama ahụ. Ọdọ ụgbọala dị n'Aroma Junction' nakwa 'Star Sunny Motor Park', tọgbọ chakoo. Ahịa gbachisiri n'Aba Ọtụ ahịa n'Aba tọgbọrọ chakoo N'Aba, dị n'Abịa steeti ndi mmadụ nọdụ n'ụlọ ha dịka otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru ka ha nọdụdụ n'ụlọ dịka Naịjirịa na-eme emume ịcheta nwereonwe ha. Onye ntakụkọ BBC gara Aba kọwara ndị mmadụ ha ka na-ele anya etu ihe ga-esi kwụru tupu ha apụọ ahịa. Ndị ahịa n'Aba rụbere isi n'ihe Ipob kwuru Ahịa Arịara gbachiri agbachi, dịka Ekeoha ShoppingCnetre, ahịa Ehi Road nọkwa n'ọnọdụ mgbachi. Mana, n'ụfọdụ mpaghara obodo ahụ ndi mmadu na-agara onwe ha ebe ụlọ ahịa gbachikwara agbachi. Etu Abakiliki siri mee n'ụbọchi mbụ n'Ọktoba N'agbanyeghi na ọkwa 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' nke Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu na-akwado nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere maka ụbọchị taa, ndị mmadụ na-agagharịrị onwe ha n'Ebonyi steeti. Onye ntaakụkọ anyị nọ na steeti ahụ gagharịrị ebe ọ hụrụ ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'isiobodo Abakaliki, mana o kwukwara na ọ hụrụ ebe a gbachiri ụfọdụ ọnụ ụlọahịa bido ebe elekere asaa ruo ebe itoolu nke ụtụtụ. Ụfọdụ ndị gwara ya okwu kwuru sị na ha ọnọdụ Naịjiria nọ na ya ugbua anaghị enye ha ọṅụ. Ha kwuru na obi adịghị ha mma na ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi ka na-egbu ndị mmadụ na Naịjiria. Ha kwukwara na akụnaụba obodo Naịjirịa adịghị mma, nke mere ka ihe taa akpụ. Umuahia Orie ụgba dị n'Umuahia Oku ndị IPOB kpọrọ ka ndị mmadụ ghara iputa ezi kuru afo n'ala n'isi ọchịchị obodo Abia steeti bu Umuahia dịka ndị bi n'obodo ahụ ka ahụrụ ka ha na-aga ihe nke diri ha na enweghi nsogbu ọbula. Na Isiama Afaraukwu bụ obodo onyeisi ndị otu a bụ Nnamdi Kanu, onye nta akuko anyị hụtara ka ndi obodo ahu na ndị bikwa n'ime ya mepechara ebe ha na-azụ ahịa ha. N'otu aka ahu, n'ebe ozọ n'ime obodo Umuahia, ahụtakwara ndị mmadu ka ha nọ n'ebe ha nọ na-atu mgbere na enweghi ọdachi ọbula. Okwuchi Angela, Chibuike Stephen Ogbulafor, Ogechi Nwachukwu siri na ọ bụ ezie na enyere iwu ka mmadụ ọbụla ghara ipụta ezi, ma ha kọwara na iwu a adịchaghị ire n'isi ọchịchị obodo Abia steeti bụ Umuahia na kwa obodo ndị ọzọ dị gburugburu ya. Owere Ọtụtụ mmadu n'Owere bụ isi obodo Imo steeti na-agara onwe ha ebe dị ha mkpa n'agbanyeghi na otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa ma nwete mba a kpọrọ Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru ka ndi Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nọdụ n'ụlọ n'ụbọchị Ọktoba 1. Site Dọuglas Road ruo ụzọ Mahadum Naze, ndị mmadu na-aga onwe ha dịka ụgbọala na-agba. Ọ bụkwa etu ahụ ka o siri kwụrụ n'Aba road. Ahịa na-azụ ebe. Dịka ụbọchị a bụ ịnọdụ n'ụlọ ndị ọrụ nke gọọmentị tinyere, ụlọ ọru dị ka ụlụ akụ nakwa ụlọ ọrụ gọọmentị gbachiri agbachi. Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma mekwara emume ncheta oge nwereonwe Naịjirịa site n'ikiri ndị agha Bekee kpọrọ ""marching"" n'Owere. Ihe gọọmentị ụfọdụ steeti n'Ọwụwa Anyanwụ kwuru maka atụmatụ Ipob ka a nọdụ n'ụlọ N'Abịa Okezie Ikpeazu banyere ọchịchị agba nke mbụ dịka Gọvanọ Abia n'afọ 2015 Ụlọọrụ 'Civil Defence' n'Abịa steeti ezipụla ndị otu ha na mpaghara e nwere ike inwe nsogbu dịka ụlọakwụkwọ,ahịa ọdọụgbọala, iji hụ na-enwere ezi nchekwa mmadụ na akụnaụba. Nke a na-abịa dịka e ziterela ha onyeisi ọhụrụ na steeti ahụ aha ya bụ Vincent Ogu. N'ozi nke ọnụ na-ekwuru NSCDC na steeti ahụ bụ Agu Ndukwe binyere aka, ha kwuru na ha dị njikere isonye ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ rụọ ọrụ ịkpa udo ụbọchị ahụ. N'Imo N'Imo steeti, ndị uweojii agwala ndị Imo ka ha pụta gawara onwe ha mkpa, dịka ha kwere nkwa inye ha ezigbo ncheckwa ụbọchụ Oktoba mbụ. Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa wujuru n'okporoụzọ n'Owere n' ụbọchị Wenezde dịka ha malitere atụmatụ iji gosi na ha kwụ chịm maka emume Ncheta Nwereonwe Naijiria. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu gwara ụlọakụkọ Punch na ya bụ atụmatụ igosi na ha kwụ chịm na-eso oku otu Ipob kpọrọ ka ndị mmadụ nọọ n'ụlọ. Ihe Ipob si ka e mee bụ ịkwado Naịjirịa - Massob Otu so agba mbọ maka nnwereonwe Biafra, bụ 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra' (Massob) ekwuola na ha akwadoghi oku Ipob kpọrọ ka ndị Igbo nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị emume ncheta nnwereonwe Naịjirịa n'aka ndị Briten bụ Ọkutoba 1. Ọnụ na-ekwuru Massobu bụ Samuel Edeson kwuru na atụmatụ ahụ ""bụ ịkwado ọchịchị Naijiria"". Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ Otu Ipob kpọrọ oku ka ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị mbụ nke Oktoba ""iji kwanyere ụmụ Igbo ndị ọchịehi nakwa ndị oyiegwu gburu ugwu"". N'ozi nke Emma Powerful binyere aka, ha kwuru na ha nwetara ozi mgbaama na ""ndị otu oyiegwu chọrọ igbusi ụmụaka ma ha gaa emume indipenda na Ọkutoba 1."" Powerful dere sị: ""Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ njedebe iyi egwu, na ịgba ọnyụpa, gosi iwe gị site n'ịnọ n'ụlọ n'abalị mbụ nke ọnwa Okutoba."" Ihe Massob kwuru maka October 1 Mana Massob, site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Samuel Edeson, kwuru na ya bụ ntuziaka Ipob nyere bụ 'ịkwanyere Naijiria ugwu"", na ""ọ bụghị ndị Biafra"". Edeson sị, ""Ipob na Massob bụ nwanne, mana ihe banyere October 1st bụ ụbọchị Naijiria ji echeta nnwereonwe ha."" ""Ihe ọbụla ha tinyere maka 'October 1st', ndị mba ọzọ ga-eche na ọ bụ iji kwanyere ndị Naijiria ugwu."" O kwuru na kama ịnọ n'ụlọ ụbọchị emume indipenda, Ipob kwesịrị ịgwa ndị Igbo ka onye ọbụla gawara onwe ya mkpa ya dịka ndị Naijiria ga-anọ n'ụlọ. ""Gọọmenti Naijiria emeela ya na ndịọrụ dị icheiche; ndị ụlọakụ, na ụlọakwụkwọ ga- anọrọ n'ụlọ, kedụ ka isi aga-etinye nke gị ụbọchị ahụ?"" ""Ọ bụrụ na ha chọrọ icheta mgbe ndị oyiegwu gburu ndị Igbo, o kwesịrị ịbụ Mee 30 bụ ụbọchị Ncheta Nnwereonwe Biafra."" Ọ gara n'ihu sị na ntuziaka Ipob "" na-adịka ọ bụ ihe gọọmenti Naijiria tinyere ka anyị na-eme."" ""Ihe o gosiri bụ na ụnụ na Gọọmenti Naijiria na-arụkọ."" Mbọ BBC Igbo gbara inweta ọsịsa ndị otu Ipob amịtaghị mkpuru. Mgbe a kpọrọ ekwenti Emma Poweful nakwa ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakọ, ekwentị ha agaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56334853,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56334853,"Ihite Uboma unrest: Ụmụ ntorobịa iwe dị n'obi agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ maka onye otu ha e gburu n'Ihite Uboma, Imo steeti","Akụkọ na-eru anyị ntị n'ehihie a bụ na ụmụ ntorobịa Umuderim, dị n'Okpuruọchịchị Ihite Uboma dị n'Imo steeti ewerela iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'ebe ahụ.","Onye nta akụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ sị na ihe butere ya bụ ọkụ gbụgbụ bụ maka onye onye otu ha ndị uweojii gbagburu. ""Ndị uweojii nọ ebe ahụ riri mbọmbọ ọsọ ka ha hụrụ ụmụ ntorobịa ha ji iwe abia ebe ahụ"" Ọ dị ka nke ahụ ezughị, ndị nọ ebe ya bụ ihe mere kwuru umu ntorobia ndị ọzọ bịakwara soro ha gbawa ebe ndị ọzọ ọkụ. Ụmụ ntorobịa iwe dị n'obi agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ maka onye otu ha e gburu n'Ihite Uboma, Imo steeti Ha sị na 'agbara ụlọọrụ Isi okpuruọchịchị obodo dị ebe ahụ, ụlọikpe, ụlọọrụ na-ahụ maka ụlọakwụkwọ Praịmarị bụ ""Local Education Authority "" nakwa ụfọdụ ụgbọla. Akụkọ ka na-abịa." afirika-43137885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43137885,Ejiji ankara 5 Chimamanda Adichie pụrụ iche,Ọ bụghị ịhe nzụzo na Chimamanda Ngozi Adichie na-akwado uwe emepụtara na Naịjirịa na atụmatu ọkpọrọ 'Made in Nigeria' nke o na egosi na peeji Instagram ya.,"Chimamanda Ngozi Adichie na akwadọ ndị Naịjirịa na-akwa uwe ọfụma Nwaafọ Igbo a na eyipụtakwa uwe ndị a ọfụma na mmemme niile ọ na-aga. N'ime uwe Chimamanda dị na Instagram, anyi hopụtara 5 eji akwa a na-akpọ ankara mee. Lee ugboro 5 a o ji ejiji ya gbaka anyị ịsị! End of Instagram post, 1 Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48037026,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48037026,Igbo Origin: Aguleri na Nri na-azọ ndị bụ isi Igbo,Nke a bụ ihe nkiri nke mbụ banyere nrụrịtaụka ebe Igbo si.,"BBC Igbo gara obodo Aguleri na obodo Nri iji mata isi okwu ndọrọndọrọ a. N'agba nke a, ndi Aguleri na ndị Nri tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Gee ha ntị ka ị ghọta ma ọ dabara. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44285021,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44285021,Rọshia 2018 fọrọ abalị 9: Goolu m agaghị echefu n'asọmpi iko mbaụwa,Ihe ndị mmadụ na-elegara anya n'asọmpi bọọlụ abụghị naanị goolu mana ọ bụ etu e si nyee ya bụ goolu.,"Ụfọdụ goolu bụ ndị anaghị echefu echefu maka etu onye nyere ya si gbabaa bọọlụ ahụ na nko na-enye ọnụ. BBC Igbo weghachiri ndị mmaọdụ azụ ka ha cheta goolu ndị pụrụiche n'asọmpi iko mbaụwa. Ha chetara goolu ndị nyere ha ọnụ maa mepụtakwa ihu Naịjirịa, abọ ha kpụ n'ọnụ bụ goolu Rashidi Yekini na Sunday Oliseh n'afọ 1994. Lee ka ụfọdụ n'ime ha si wee kọwapụta etu Oliseh na Yekini si nyee goolu ndị ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 46427161,https://www.bbc.com/igbo/46427161,"Let's Get Nigeria Working Again: Aga m eji ọrụ, nchekwa na ndinotu chọọ ụmụ Naịjirịa mma",Onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar na osote ya bụ Peter Obi amalitela ịgba ọsọ achụm nta Vootu na Sokoto Steeti bụ otu n'ime ọdịda anyanwụ ugwu.,"Atiku meriri na ntuliaka imeụlọ PDP mere na ọnwa Ọktoba 2018 N'ozi ha wepụtara n'akara twitter ndị PDP, ha kwuru na ntuliaka 2019 bụ maka ọdịnihu ụmụaka na ndị ntoroọbịa Naịjirịa. Ndị otu pati si na steeti asaa gụnyere Sokoto, Zamfara, Kebbi, Jigawa, Katsina, Kano nakwa Kaduna so ya mgbe ọ gara imalite ịchụ nta vootu. A na-tụ anya na Atiku ga-emepekwa ụlọọrụ ịchụ nta vootu ya nke ga-adị na Sokoto. Ndị otu pati PDP kwuru na ha kwenyere na ọ bụ mpaghara ọdịda anyanwụ ga-edu ụzọ na Naịjirịa ma kwetekwa na ọ bụ Atiku ga-azọta oche onyeisiala na ntuliaka 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46760551,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46760551,Dino Melaye enyefela ndị uweojii onwe ya,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Sineto Dino Melaye na anọchite Kogi n'ụlọomewu enyefela onwe ya ndị uweojii.,"Dino Melaye nyefere onwe ya n'aka ndị uweojii ka ọ gachara abali asaa ha wakporo ụlọ ya ma jụụ ọpụpụ Akụkọ kwuru na ndị uweojji kpụrụ ya gawa n'isi ụlọrụ ha dị n'Abuja. End of Twitter post, 1 Ndị uweojii wakporo ụlọ Melaye dị na Maitama , Abuja abalị asaa gara aga kwechiri, jụ ọpụpụ.. Mbọ Melaye gbara iji sị n'ikike ụlọikpe chụpụ ha kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọikpe jụrụ ịza ekpere ya. Kemgbe abalị ole na ole, Ndị uweojii chọrọ ka Melaye bịa zara ọnụ ya banyere ebubo gbasara ogbugbu mmadụ nakwa ohi. Akụkọ ka na-abịa." afirika-43831290,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43831290,Akụkọ kachasi n'abalị a: Buhari bụ nna Naijiria - Adesina,"""Buhari bụ nna Naịjịrịa"" - Adesina","Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a End of Twitter post, 1 Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla akụkọ na-agagharị na Buhari kọrọ ụmụ ntorobịa Naịjirịa ọnụ. Akwụkwọ Femi Adesina dere kwuru na Buhari bụ nna Naịjirịa niile enweghi ike ịkọ ụmụ ntorobịa Naịjirịa ọnụ mana ọ bụ ndị agamevu tụụharịrị ihe o kwuru. Ebe ọzọ na Naijiria Gọọmenti Kaduna steeti akatọọla akụkọ na-agagharị na ha chụrụ ụfọdụ nime ndị nkuzi e were ọrụ ọhụrụ na steeti ahụ. Akụkọ pụtara na steeti ahụ chụrụ ndị nkuzi ọhụrụ ruru mmadụ puku ato maka na ha etozughi n'ọrụ mana gọọmenti steeti ahụ kwuru na ndị nkuzi ọhụrụ ahụ ga-ebido ọrụ n'oge na-adịghị anya. Ndị eze abụọ na-eme ihe eji kpọọ ha eze Eze nwaanyị mba Britain ekwuola na obi ga -adị ya ụtọ ma nwa ya bu nwaeze Charles rigo ọkwa ọchịụchị ndị otu Commonwealth. Ebe Eze ndị mba Swaziland gbanwere aha obodo ha na mmemme emere maka ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. Aha ọ hụrụ ya bụ zị ""Kingdom of eSwatini"" Na akụkọ egwuregwu Onye ọgbaa bọọlụ ootu Chelsea Marcos Alonso agaghị esonye na ọkara ịkpeazụ nke asọmpị iko FA n'ụbọchị Sunday. Nke a mere ebe FA machiri ya maka ọgụ ya na Shane Long lụrụ n'ụbọchị Satọday gara aga. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Asụsụ Igbo agaghị anwụ - Amarachi Atama" egwuregwu-44450021,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44450021,World Cup 2018: Falcons na-ekpere Super Eagles ekpere,Nwa agbọghọ na-agbara Super Falcons bọọlụ bụ Ugochi Desire Oparanozie ekwupụtala nkwado ya n'ebe ndị Super Eagles nọ.,"Na ngwụcha asọmpi ha na ndị Gambia ụnyaahụ ebe ha ji ọkpụ goolu isii a na-asataghị otu merie, Oparanozie gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ inye goolu anọ n'ime egwuregwu ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ maara na ndị Super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mbaụwa. Oparanozie kpeere ndị Super Eagles ekpere ọganihu. Naịjirịa ji nchịkọta ọkpụ asaa asataghị otu merie ndị Gambia iji tozuo oke n'asọmpi Iko mba Afrịka a ga-agba na Ghana n'afọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43406000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43406000,Ụgwo isi nwaaanyị o nwere uru ọ bara n'ala Igbo?,Maazị Toni Kan na Odoziaku Chidimma Franka Orjih nwere mkparitaụka na Facebook na Instagram Live anyị n'ụbọchị Maachị 14.,"Ụgwọ isi nwaanyị ọ ga-anogide? Ndị so anyị na peeji ahụ nwekwara ohere ịju ha ajụjụ ọbụla ha chọrọ. Ha kwuru maka ihe gbasara ụgwọ isi nwaanyị: ọ dị mkpa, ihe mere o ji ada ọnụ n'obodo ụfọdụ n'ala Igbo makwa okwu ndị ọzọ. Kirie ya n'uju ebe a. Content is not available End of Facebook post, 1" afirika-45255771,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45255771,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Wenger ga-eturu ugo n'aka George Weah,"Akụkọ ndị dị mkpa N'egwuregwu,","Arsene Wenger bụbụ aka chịkọtara otu bọọlụ Arsenal akwadola ị nara nturuugo n'aka onyeisiala mba Liberia bụ George Weah Nke a bụ maka mbọ ọ gbara n'aka George Weah mgbe ọ na-ebido njem ya dịka onye ọgba bọọlụ na Yurope. George nọbụ n'aka Wenger gbaa bọọlụ Na ala Igbo Ndị na-achọ Biafra ka na ekwusi ya ike Otu ụlọịkpe n'Owerri enyela iwu ka anwụchie ụmụnwaanyị ruru otu narị na iri n'anọ bụ ndị mere ngagharị iwe n'ụbọchị Fraide gara aga. Ọkaịkpe S.K. Kadurumba kwuru na o nweghi ikikere ị tọghapụ ụmụnwaanyị ahụ ebe onye ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor nọchitere anya ha kwuru na ha ga-aga ụlọikpe ka nke ahụ iji kpeghari ya bụ ikpe. Okwu nchekwa Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Mansur Dan-Alli ekwuola na n'ezie, mkpa mkpa n'akpa na mpaghara ugwu Naịjirịa ka bụ ihe oke echiche. O kwuru nke a dịka onyeisiala Muhammdu Buhari na ndị isi nchekwa ndị ọzọ nwechara nzụkọ imeụlọ ma kwuo na ha enwela mkpebi zuruoke maka ya bụ nsogbu. Gụọ ya n'uju ebe a. N'Abuja Ụlọọrụ ndị mba Amerịka na-ahụ maka ịbata mba ahụ n'Abuja ebiodola ọrụ ịnye ndị mmadụ akwụkwọ njem (""Visa"" na Bekee) eji aga mba ahụ. Cheta na n'abali ole na ole gara na ha kwuputara na ha ga-akwụsị ịnye ya bụ akwụkwọ ma ruo ugbua tụgharịa obi ha. Ha ekwughi ihe mere ha ji nwee mkpebia a na mbụ mana ha kwuru ihe adịla ka ọdị na mbụ na ebe ahụ. Na mba ofesi Ụlọakụ ndị agha Bolivia abụla ụlọakụ mbụ bidoro iji ego ọhụrụ mba Venezuela eme ihe. Onyeisi ụlọakụ ahụ depụtara ya bụ ozi n'akara Twitter ya na ha ewugharịala atụmatụ ego ma nabata ego ọhụrụ ahụ Venezuela wepụtara ego ọhụrụ maka ego ha daara nke ukwuu. Ihe nkiri nke taa Naịjirịa kwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị - Moghalu" egwuregwu-44824196,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44824196,Antonio Conte: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọchụchụ ya,"Dịka otu Chelsea chụrụ onye nchịkọta otu egwuregwu ha bụ Antonio Conte, ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị gbara bọọlụ n'okpuru ya na-ekele ya maka ọrụ ọma ọ rụrụ, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ esemokwu ya na ụfọdụ nwere butere ọchụchụ ya.","Conte buliri iko abụọ oge ọ bụ onye nchịkọta Chelsea A chụrụ Conte dị afọ 48, ụnyaahụ ka ọ chịkọtara Chelsea afọ abụọ. Dịka onye nchịkọta Chelsea, Conte buliri otu iko Premier League na otu iko FA. Ndị otu Chelsea depụtara maka ọpụpụ ya n'elu Twitter ha: End of Twitter post, 1 Na ngwụcha afọ gara aga, Chelsea kwụsịrị n'ọkwa ise na tebulu Premier League, nke pụtara na ha etozughị isonye na Champions League nke 2018/2019 site na Premier League. Ihe ndị na-agbara Chelsea na-ekwu John Terry gbaburu bọọlụ ma bulie otu iko Premier League n'okpuru Conte, kelere ya ma kwuo na ọ mụtara ọtụtụ ihe n'aka ya. Gary Cahill bụ Kaptịn ndị Chelsea kelere Conte maka afọ abụọ o nyere Chelsea. Ceaser Azpilicueta na-agba n'azụ Chelsea, sonyekwara na ndị kelere Conte maka ezi nchịkọta. Ihe ndị na-akwado Chelsea na-ekwu @manben6 na-akọwa na Conte na ọtụtụ ndị na-agbara Chelsea nwere okwu, nke butere ọchụchụ ya. @futbolJurgen na-ekwu na ọ bụ Mourinho butere ọchụchụ ya. @lorenzowisani na-akọwa na ọ bụ aha ọjọọ a na-akpọ ụbọchị ọbụla Fraịde dabara na 13 butere ọchụchụ Conte. @Tom97HD kelere Conte ọfụma maka ihe o meere Chelsea. @beejayslim2 kwuru na ndị si otu ọzọ na-akwa Chelsea emu maka ịchụpụ Conte. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55431964,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55431964,DJ Flozy: 'Ụkwụ adịghị m mma egbochighị m ị bụ DJ na-ekpo ọkụ',Nwaada Chinenye Onedibe ana etu DJ Flozy kọwara ka o siri malite ịkwọ egwụ na mmeme.,"DJ Flozy bụ onye gụrụ 'Accountancy' n'IMT, Enugwu jizi ịkwọ egwu enyere ezi na ụlọ ha aka dịka ọ bụzị onye ama ama na ya bụ ọrụaka n'Enugwu steeti nakwa gburugburu. Akụkọ DJ Flozy bu ihe ga-akwalite mmụọ ọtụtụ ndị mmadụ Were anya ga gbaara onwe gị Ekeresimesi taa. Ndi mere akụkọ a bụ Chris Okereke na Chiemela Mgbeahụrụ" afirika-48652240,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48652240,Father's day: Gịnị ka ụbọchị emume ndị nna pụtara gi?,Ndị nna de jeenu o!,"Nne : I tinyekwara ose ? Ta a bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa June, ọtụtụ mba na-eweliri ndị nna aka elu maka uru ha bara n'ezinaụlọ nakwa na nwulite obodo. Onye nwere nna leta ya anya nke ọma maka ifunanya Nna nwere ebe umu ha nọ karịrị ego. Ka emume a si gaa n'akụkọ ụfọdụ Ndị nna siri nrị n'ebe dịka ụlọ ụka St, Barths Anglican Church dị na Satellite. Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ gosiri obi ụtọ ha gbasara isi nrị ebe onye dịka Ụba Osakwe kwuru na agbanyeghị na ọ masịrị ya ime , o kwesịghị ị bụ mgbe ọ bụla. Ụkọchukwu Emmanuel Umeh kwuru na ọ bụ ụbọchị eji agọzị ndị nna n'ụzọ pụrụ iche ma kwu kwa mkpa ọ dị ka ụmụnwoke na-etinye anya ụfọdụ oge ma esiwe nrị n'ụlọ makana o na-enye ụmụ nwaanyị obi ụtọ ma di ha bia nyere ha aka n'usekwu. Ebe Okenye Uche Aguegbo kwuru na ụbọchị a dị mma maka ị chetara ndị nna ọrụ ha ka ihe wee na-aga n'iru. Ndị mmadụ kwukwara ọtụtụ ihe n'elu twitter @OpeyemiOfficial kwuru na ọ hụrụ nna ya n'anya nke ụkwụ. @atiku na-ekele ndị nna malitere Naịjirịa.‏ @JorimJerry kwuru na owu nna nwụrụlanụ na-ama ya. @bukolasaraki kelere ndị nna niile na-agba mbọ imeta ndị na-elekwasa anya. Nchọpụta Ọgbakọ 'European Union' Ngwa ọrụ INEC Ọgbakọ European Union agụpụtala ebe ndị Goọmentị dara iwu maka ntuliaka emere ma nyekwa atụmatụ na ntuziaka maka ime ntụliaka n'odịnihu. Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ha ga-eme ntuziaka European Union wepụtara maka ntụliaka ọdịnihu Naịjirịa. Ọgbakọ ""European Union"" kwuru maka uru ọ bara ịhazigharị etu esi eme ntụliaka na Naịjirịa ma na-ekwu na etu esi chịkọta mpụtara ntuliaka 2019 adabachaghị ọfụma. N'egwuregwu, Ndị otu egwu bọọlụ Ukraine Ukraine efeela South Korea aka n'isi were ọkpụ goolu atọ asatara otu maburu iko mbaụwa ndị ntorobịa. Nke a bụ nke mbu ndị Ukraine na-ebu iko mba uwa ndị ntorobia. N'ofesi, Ndị Uweojii Kenya Ogbunigwe egbuola ndị uweojii ruru asatọ ebe ha nọ n'ụgbọala ngagharị nchekwa. Onyeisi ndị uweojii na kenya bụ Hillary Mutyambai kwuru na ndị uweojii ruru iri na otu nọ n'ụgbọala ahụ na-agaghari n'oke kewara Kenya na Somali. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Nollywood: 'Ekike nwata akwụkwọ m na-eti na-enye m anụrị'" afirika-53410699,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53410699,WTO DG: Lee ihe mere Ngozi Okonjo-Iweala eburubeghi oche eze na WTO,Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mba so n'otu 'World Trade Organisation' kwadoro Ngozi Okonjo-Iweala mana nke a ezubeghi iji akpọpụta ya dịka onyeisi ọhụrụ otu a.,"Okonjo-Iweala sepụtara isi dịka onye nwereike ịbụ onyeisi otu WTO ọhụrụ ndị nwere agba n'otu WTO nyere atụmatụ ka Okonjo-Iweala bụrụ onyeisi ha. Ndịisi atọ na-anọchiteanya otu WTO a kpọrọ 'Troika' kwadoro Okonjo-Iweala mana a na-eche ka mmadụ 164 so n'otu a kwadoo mkpebi a. Site na ntuliaka e mere n'ụbọchị Wenesde 28 Ọktoba, 2020, Okonjo-Iweala nwetere nkwado kachasị mana mba Amerịka akwadoghi ya. Ndị na-ekwuchitere Okonjo-Iweala ọnụ sị na obi dị Okonjo-Iweala ụtọ na nkwado e nyere ya mana ọ na-eche ka a kpọpụta aha ya n'ụbọchị 9 Nọvemba, 2020. A na-atụ anya na ndị otu a ga-akpọ aha mgbe ndị otu a ga-ezuko inwe nkwekọrịta tara ọchịchị n'etiti ha. Ọ bụrụ na nke a mee, Okonjo-Iweala ga-abụ nwaanyị mbụ n'ụwa nakwa Afrịka ga-anọ n'ọkwa a kamge afọ 25 e hiwere otu a. Gịnị mere Amerịka akwadoghi Okonjo-Iweala? Dịka onye ntaakụkọ BBC n'okwu akụnaụba bụ Andrew Walker si kwuo, mba Amerịka kwadoro ka Myung-hee nke Korịa maka na ""o nwere ahụmihe n'azụmaagịa mba na mba nakwa etu o si agbapụ ọzọ n'ime ihe"" Ha ekwughi kpọmkwem ihe mere ha akwadoghi Okonjo-Iweala. Anyị enweghikwa ndị ga-azụ mmanụ agbịdị anyị. Kedụ ndị so Ngozi Okonjo-Iweala zọọ ọkwa a? Otu 'World Trade Organisation' ewepụla mmadụ atọ so azọ ọkwa onyeisi otu ma hapụ Okonjo-Iweala n'ọsọ oche ahụ. WTO wepụrụ Jesus Seade nke Mexico, Hamid Mamdouh nke Egypt nakwa Tudor Ulianovschi nke Moldova n'agba nke mbụ n'ime atọ nke atụmvootu ha. N'ozi WTO wepụtara n'akara Twitter ha, ha kwuru na ""ndị ga-abanye agba nke abụọ na ntule onye ga-abụ onyeisi WTO gụnyere Ngozi Okonjo-Iwela(Nigeria); Yoo Myung-hee(Korea;Amina C Mohammed(Kenya, Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia) na Liam Fox(United Kingdom). A ga-eme ya bụ agba nke abụọ ntule n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Septemba, ebe nke atọ ebe a ga-ekwupụta mmadụ abụọ fọrọ n'ọsọ ikpeazụ ga-abụ abalị isii nke ọnwa Oktoba. Lee ndị na-eche Ngozi Okonjo-Iweala aka mgba maka ọkwa onyeisi WTO Ndị na-azọ ọkwa onye nchịkọa otu 'World Trade Organisation' (WTO) Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ekpe ekpere ka Ngozi Okonjo-Iweala bụrụ onye nchịkọta otu ahịa mbaụwa a kporọ 'World Trade Organisation' na Bekee. Okonjo-Iweala bụ nwa ada ude ya na-ede na mbaụwa niile n'ihi etu ụbụrụ ya si acha ọkụ. Ngozi Okonjo-Iweala: Ihe ndị aga-eme ka akụnaụba ala anyị ghara ịdakpọ n'ihi coronavirus Ọ rụọla ọrụ ugboro abụọ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo nakwa Goodluck Jonathan bụ onyeisiala. Ọ bụkwara osote onyeisi ụlọakụ mbaụwa (World Bank), ma nọrọkwa n'isioche ọtụtụ ụlọọrụ na ngalaba a ma aha ha n'ụwa. Ndị a gụnyere Twitter, Gavi, ụlọakụ 'Standard Chartered', dịrị gawazie. Mana mmadụ asaa ọzọ egosikwala mmasị ha iso Okonjo-Iweala zọọ ọkwa 'Director General' nke WTO. O lee ndị ka ha bụ? 1) Jesús Seade Kuri (Mexico) Jesús Seade Kuri Kuri bụ onye kacha mee okenye n'ime ndị niile so azọ ọkwa a. Ọ gbara afọ iri asaa na atọ (73). Kuri arụọla ọrụ na WTO, 'International Moonetary Fund' nakwa n'ụlọakụ mbaụwa (World Bank). Ọ rụkwaala ọrụ na gọọmentị Mexico. 2) Abdel-Hamid Mamdouh (Egypt) Ọ bụ onye ọkaiwu nakwa ọka nkuzi a ma ama. Mamdouh arụkwaala ọrụ na WTO, ma bụrụkwa onye nọchiri anya mba Egypt n'okwu azụmahịa na mba Ethiopia, Switzerland, nakwa Australia. Ọ gbara afọ iri isii na asatọ (68). 3) Yoo Myung-hee (South Korea) Myung-hee bụ nwaanyị nke mbu rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta azụmahịa nke mba South Korea Ọ gbara afọ iri ise na atọ (53) Ọ rụọla ọrụ ihe gbasara azụmahịa mbaụwa ruo afọ iri abụọ na ise (25) O so na ndị nyere aka hazigharịa azụmahịa mba Korea ka ọrịa coronavirus ghara imekpa ha ahụ. 4 Tudor Ulianovschi (Moldova) Onye nke a bụ onye kacha dụrụ nwata n'ime ndị niile na-azọ ọkwa onye nchịkọta otu WTO. Ọ gbara naanị afọ iri atọ na asaa (37). Tudor rụburu ọrụ dịka Mịnịsta hụrụ maka mmekọrịta mba Moldova na mba ndị ọzọ, nke Bekee kpọrọ 'Foreign Affairs'. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nnọchite anya mba ahụ na Switzerland na Liechtenstein. 5) Amina C. Mohamed (Kenya) Onye nke a abụghịkwa Amina Mohammed nke rụburu ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka gburugburu (environment) na Naịjirịa, ọ bụ onye Kenya. Amina arụọla ọrụ nke ọma n'otu WTO dịka onyeisioche ọgbakọ ọha (General Council), nakwa onyeisi oche ngalaba na-ekpezi esemokwu nke Bekee kpọrọ 'Dispute and Settlement Body'. Ọ rụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta na ngalaba dị icheiche na gọọmentị mba Kenya. Amina gbara afọ isi ise na asatọ (58). 6) Mohammad Maziad Al-Tuwaijri (Saudi Arabia) Mohammad Maziad Al-Tuwaijri Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka nhazi akụnaụba na Saudi Arabia. Ọ bụkwa onye na-akwọ ụgbọelu (pilot) ma bụrụkwa onye ọrụ ụlọakụ n'oge gara aga. Ụlọakụ ebe ọ rụburu ọrụ gụnyere 'Saudi British Bank', J.P.Morgan nakwa HSBC. Ọ dị afọ iri isii. 7) Liam Fox (United Kingdom) Liam Fox Fox gbara afọ iri ise na asatọ (58) Ọ rụrụ ọrụ dịka ode akwụkwọ ukwu na-ahụ maka azụmahịa n'oge Theresa May bụ Praịm Mịnịsta mba UK. A mụrụ ya na Scotland, ọ gụọ akwụkwọ na Mahadum Glasgow ebe ọ natara ọzụzụ dịka dịbia bekee. Ọ rụrụ ọrụ dịka dọkịta na ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Service'. Roberto Azevedo bụ onye nchịkọta WTO ugbua mana ọ ga-arịtu na ngwụcha ọnwa Ọgọst Roberto Azevedo, onye ji ọkwa 'director general' nke otu WTO ugbua, ekwuola na ya ga-aritu na ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 2020. Ọ bụ afọ anọ ka mmadụ na-anọ na ya bụ ọkwa, mana e nwere ike inye mmadụ ohere ka ọ chịa nke ugboro abụọ. E tinyere Azevedo n'ọkwa ahụ n'afọ 2013, ma nyekwa ya ohere nke abụọ na 2017. Mana o kwuru na ya agaghị eche ka oge ya gwụ na 2021 tupu ọ rituo. Usoro e si ahọpụta onye nchịkọta WTO Ọ bụ mba dị iche iche ga-ahọpụta onye nke ha chọrọ ka ọ chịa otu WTO. Nhọpụta a akwụsịla n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị. Ndị a họpụtara ga-amalite igosipụta onwe ha nakwa ịgwa ọha obodo ihe ha bu n'obi ime ma ha nweta ya bụ ọkwa. Agba nke a ga-akwụsị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba. Nke a gachaa, ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-amalitezi ọgbakọ ebe ha ga-anọ tulee ndị niile a họpụtara ma jụọ ese niile ha kwesịrị ịjụ. Agba nke a na-ewe ihe dịka ọnwa abụọ. N'ikpeazụ ka ha ga-ahọpụtazi onye meriri ya bụ asọmpi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 48545074,https://www.bbc.com/igbo/48545074,Ahmad Ahmad's Arrest : A nwụchiela onyeisi CAF maka ebubo nrụrụaka,"Confederation of African Football(CAF) bụ otu na-achịka egwu bọọlụ n' Afrịka ekwuola n'ezie na anwụchiri onnyeisi ha bụ Ahmad Ahmad na Paris maka 'ihe gbasara nnyocha ọkwa ya dịka onyeisi Caf."" maka ghị ihe ọbụla maka kepukepu na ndị uweojii nwụchiri onyeisi ha bụ Ahmad Ahmad maka ebubo nrụrụaka.","Ahmad Ahmad banyere ọkwa dịka Caf ka Issa Hayatou pụchara na Maach 2017 Ha kwuru na ""Fifa amaghị kpọmkwem ihe gbasara nnyocha ahụ, ya mere na ha enweghị ike ikwu ihe ọ bụla banyere okwu ahụ."" ""Fifa na-ajụ ndị gọọmenti France maka ozi banyere nnyocha ahụ nke na-aga na kọmịti na-ahụ maka eziagwa."" Akwụkwọ akụkọ Jeune Afrique kwuru na a nwụchiri Ahmad n'ụtụ Tọzde na Berri Hotel dị na Paris maka ebubo nrụrụaka gbasara ụlọọrụ a kpọrọ, Tactical Steel. A kagbuola asọmpi Caf ikpeazụ a gbara Ndị otu egwu Wyad na-eti mkpu na-agwa rogbu bọọlụ Cheta na Caf ekwuru n'asompi ikpeazụ Caf e mere n'abalị May 31, afọ 2019, nke Espérance de Tunis na Wyadd Casablanca gbara adabaghị n'anya ya, ma nye iwu na a ga asọgharị ya. Ha kwuru na ha ga-enwe mkpebi ebe na ụbọchị a ga-emegharị asọmpi ahụ." afirika-43586194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43586194,Njem Buharị: ọ bịara ịnata nkwado Tinubu maka 2019?,"Ọtụtụ ndị njem gụnyere ndị njem ụgbọelu, ji ụkwụ gaa ogologo ụzọ n'ụbọchị Tọọsde, Maachị 29, na Legọs dịka e mechiri okporoụzọ na-aga ọdọụgbọelu na ụfọdụ okporoụzọ maka na onyeisiala Muhammadu Buhari gara njem nleta abalị abụọ na steeti ahụ.","Buhari mere Tinubu onye isi otu na-ekere ndị otu APC na-ese okwu udo Buhari gara mepee nnukwu ọdọụgbọala n'isi obodo Legọs bụ Ikeja, ma mecha gaa ọgbakọ mkparitaụka e hiwere iji mee ncheta ụbọchị ọmụmụ onyendu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu, onye gbara afọ iri isii na isii (66). End of Twitter post, 1 Mana dịka ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru, njem ahụ abụghị ihe a kpọrọ ya ka ọ bụ, kama na ọ bụ ịwụ ala mmiri maka ntuliaka 2019. N'ụbọchị Wenesde, gọọmentị Legọs steeti mara ọkwa mmechi ọrụ nakwa okporoụzọ ụfọdụ maka abalị abụọ; ụbọchị Tọọsde na Fraide, Buhari ga-eme njem ahụ. Nke metụtara ebe ọ dị ukwuu, mkpagharị ndị mmadụ, azụmahịa na iji ego chụọ ego na steeti nke na ọtụtụ ndị mmadụ kwusịrị ọrụ, ahịa, ebe ọtụtụ, nke mere ka nde kwuru nde ego gbanahụrụ steeti ahụ n'ihi njem onyeisiala. Akụkọ ga-amasị gị Nke a kpasuru ọtụtụ mmadụ iwe nke mere na ha tụrụ arịrị n'igwe okwu Twitter: Nke a bụ mbụ Muhammadu Buhari na-abia Legos bụ ebe a maara dịka isi obodo akụnaụba Naijiria kemgbe o jiri banye n'ọkwa ọchịchị afọ atọ gara aga. Dika Sam Olisa, onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Afrika si kwuo, Buhari bịara Legos maka inweta nkwado Tinubu maka 2019. ""Anyị kwesiri ịmata etu Asiwaju Tinubu si dị mkpa na mmeri Buhari nwere na ntuliaka emeburu na mbụ. Kemgbe o jiri banye ọkwa ọchịchị, Buharị abịabeghị Legọs. Ihe o jiri bịa bụ maka ịnweta nkwado Tinubu na ntulika na-abia na 2019."" Cheta na nsonso a, Buhari mere Ahmed Tinubu onyeisi kọmịti ga-ekpezi esemokwu dị n'etiti ndị otu pati ha bụ APC. Ọ gara n'ihu kwado ka ewepụ onyeisioche party ha bụ Oyegun, onye nke Tinubu akwadoghị ọchịchị ya n'otu ha. Nke mere ọtụtụ ndị na-ele ka o sị eme ji ekwu na ọ bụ maka 2019 n'ihi na kemgbe Buhari jiri banye n'ọchịchị, ọ gbakọtara onyendu pati ya bụ APC bụ Ahmed Tinubu onye bụ isi ejiri kwaba okpu n'inyeaka ka onwee mmeri na ntuliaka nke 2015. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Asiwaju bụ onye Aisha Buhari, nwunye onyeisiala, bu n'obi mgbe ọ gwara BBC na mkparịtaụka o nwere n'afọ gara aga na di ya gbakọtara ndị nyerela ya aka na ntuliaka azụ, ma makụọ ndị ya amaghị n'ọchịchị ya." afirika-43446709,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43446709,'Ndị Boko Haram egbuola ndị ọkụ azụ 5 na Lake Chad,Akụkọ na pụta site ụwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa na ekwu na ndị omokome a na-eche na ha bu ndị Boko Haram egbuola mmadụ ise bụ ndị na-akụ azụ na Lake Chad.,"Ndị agha si Chad, Naịjirịa na Cameroon na-ebuso ndị Boko Haram agha Ihe a mere na ime obodo dị na Lake Chad. Onyendu ndị na-akọ azu na Borno Steeti bụ Abubakar Gamandi siri na egburu ndị a maka ha na enyere ndị agha Naịjiria aka n'ịchọ ụmụakwụkwọ a nwụchịrị na Dapchi na ọnwa gara aga. Mwakpo a ejiri gbuo ndị a mere na ala miri gara okirikiri a na-akpọ Tudun Umbrella n'ime Lake Chad, bụ ebe Naịjirịa, Chad na Cameroon nwere ụsọ. Onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari sị na ya na-agba oke mbọ ka a hụ na ụmụakwụkwọ a ndị Boko Haram tọọrọ laghachitere. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44972365,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44972365,Nwaada a ji ịnya ụgbọala akpata ego,"Ebe ọrụ ịnya ụgbọala akpata ego dịka ọrụ ahapụrụ naanị ụmụnwoke, nwaagbọghọ a kara obi tinye isi na ya bụ ọrụ.","Kelechi Nwamkpa bụ onye fechere ala nna na 2017 egbughị oge ya ịchọ ọrụ bekee dịka ndị ọzọ si eme. Ngwa ngwa ọ mechere, ọ malitere ịnya ụgbọala eji ekwentị akpọ ndị ahịa bụ nke nyekwere ya aka ị chọta ndị ahịa n'ụlọọrụ ezigara ya maka ife ala nna. Lee ka nwafọ Igbo asị agba mbọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47285448,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47285448,Chelsea vs Man United: A gbaalara Chelsea ụgbọ nwamkpi,"Ka ndị Chelsea na-asị ""ọzọ emela"", ọzọ emeela n'aka otu egwuregwu bọọlụ ọzọ si mpaghara Manchester dị na UK.","Na-erughi izu abụọ Manchester City gwọrọ Chelsea ka abacha, otu Manchester United gosiri Chelsea nkarị ka ha ji ọkpụ goolu abụọ zọpụ ha n'lko FA. Goolu abụọ Ander Herrera na Paul Pogba nyere n'ọkara nke mbụ, mere ka Chelsea laa ""kanaị"" na ya bụ asọmpi. End of Twitter post, 1 Ka e mechara, oge ndị na-akwado Man Utd malitere ịgụ egwu sị ""a ga-achụ Sarri (onye nkuzi Chelsea) n'ụtụtụ"", ndị na-akwado Chelsea mechara sonye ha na-agụ ya bụ egwu. Cheta na Chelsea ga-ezute Manchester City ọzọ n'ụbọchị 24 n'asọmpi Iko Carabao, mana isi ha a ga-apụta na ya? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43031907,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43031907,EEDC: Anyị akpaghị mita ọkụ aka,Ngalaba na-eke ọkụ latrik na mpaghara Enugu nke a kpọrọ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) na bekee agọrọla aka ha n'ebubo ndị mmadụ na-ebo ha na ha na-apịgharị mita ọkụ kwụọ-ụgwọ-ka-isi-mụọ ọkụ (prepaid meter) ha aka maka iji rite oke uru.,"A na ebo ndị ọrụ ụlọọrụ ọkụ latrik na ha na-akpa aka na mita Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Emeka Ezeh, gọrọ agọ a n'ajụjụọnụ ya na ndị ụlọọrụ ntakụkọ, News Agency of Nigeria, nwere n'Aba. Ọ sịrị n'ụlọọrụ ha amaghị ọrụ gbasara idogharị mita. Okwu ọnụ ya: ""Nke a abụghị eziokwu. O nweghị onye ọrụ anyị ma anya ndogharị mita - belụsọ n'onye ahụ ọchọrọ imebi ya - maka na mita ha bụ nke ndị agba ọhụrụ. ""Ikekwa, o nwere ndị ọrụ anyị achọghị ka ha mee ka obi jụọ ndị mmadụ oyi n'ihe gbasara ịnara mita ọhụrụ ahụ."" ""Cheta na ọ bụrụ n'onye ọbụla nwe mita ọkụ kwụọ-ụgwọ-ka-isi-mụọ ọkụ, agaghị enwe ohere igbubi ọkụ kwa ọnwa, belụsọ ma onye ahụ ewepụrụ ọkụ na mita ya."" Ọ kọwara na ọ marala ụfọdụ ndị ụlọọrụ ha ahụ ịnapụ ndị mmadụ akwụghị ụgwọ ọkụ ego aka azụ. Mana, mita ọhụrụ ga-eweta nke a n'isi njedebe'. Ezeh gwara ndị mmadụ ka ha kpesa onye ọrụ ha ọbụla kpara mita ha aka ka a taa ya ahụhụ kwesịrị ekwesị. Ọ tụnyere ha alo ka ha na-agbanyụ ọkụ ha na ihe ọbụla ji ọkụ arụ ọrụ iji mee ka ha ghara ị na-emefu ego." 43854703,https://www.bbc.com/igbo/43854703,Mmọnwụ wakporo ụlọụka Fada 'Ebube mụọnsọ',"Ndị mmọnwụ na-eme emume, 'Ụzọ Iyi' n'Uke dị n'ọkpuru ọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti wakporo ọgbakọ ekpere ndị ụka Katolik ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ, merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ, ebe e chere n'otu onye ha mara mma nwuru n'ụbọchị Satọde.","Ịgba mmọnwụ bụ emume omenala e jiri mara Ndigbo Onyeisi nchụaja ọgbakọ ụlọụka ahụ bụ Fada Emmanuel Obimma, nke a ma ama dị ka 'Ebube Mmụọnsọ' na ndị ụkọchụkwụ ndị ọzọ, na ndị ụmụnwaanyị e chiri echichi bịara ebe ahụ gbalahụrụ ndị ntorobịa ahụ wakporo ndị gara ikpere Chineke n'ụka ncheabalị ha mere n'abali Fraide banye n'isi ụtụtụ Satode. Onye nnyemaka ụkọchụkwụ bụ Francis Okoye gwara onye ntaakụkọ BBC n'ekwentị na ndị mmọnwụ wakporo ebe ọgbakọ ụka abalị ahụ n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ. ""Mgbe ihe mechazịrị, anyị gụkọrọ ụgbọala ha mebirị gụta ịrị atọ. Ha merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. O nwere ọtụ onye ha sụrụ mma e bugara ụlọ ọgwụ. Anyị amabeghị ma ọdị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ."" ""O were anya na ndị ntorobịa Uke mere ihe a kwadoro akwado imekpa ndị ụka ahụ n'ihi na, a na-eme 'Uzọ iyi', mmọnwụ na-agbadebe ma ọ kụọ elekere isii nke mgbede mana ndị mmọnwụ a wakpọrọ ebe a na-eme ụka abalị ka ọ kụchara elekere asatọ nke abalị. ""Ha bidoro na-eti ndị ji ụgbọala ebute ndị mmadụ bịara ụka ihe, na-anara ha ego ha nakwa ekwentị ha. Mmọnwụ mebiri ọtụtụ ụgbọla n'ọgbakọ ahụ ""Ndị ọrụ nche anyị nwara ike ha ịkwụsị ha imebi ihe mana mgbe anyị hụrụ na ihe na-eme akarịala, anyị kpọrọ ndị uweojii oku. Ha bịara nwụchie ụfọdụ n'ime ha."" Ndị uweojii Anambra steeti kwuru n'ezie na mmọnwụ wakporo ndịụka n'Uke mana ha kwuru na onweghị onye nwụrụ. Ọnụ na-ekwucitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nkirụ Nwode gwara BBC na ""Anyi nwụchịrị mmọnwụ atọ, anyị na-enyocha ihe mere ebe ahụ."" Akụkọ kwuru na nke a abụghị mbụ ndị ntorobịa obodo ahụ na-emekpa ndị na-aga ọgbakọ a pụrụiche ndị ụka Katolik na-eme kwa abalị Fraide nke na-adọta ihe karịrị pụkụ iri abụọ kwa izuụka. Ndị nọ ebe ihe meere kwuru na ndị ntorobịa obodo ahụ na-esogbu ndị ọkwọụgbọala na ndịụka na-anapụ ha ego ma na-etikwa ụfọdụ ihe. Na nsonso, ha tiri onye ọrụ Fada Obimma ihe nke mere ụkọchụkwụ ahụ ji kpesara ndịuweojii ndị nwụchịrị ndị ntorobịa ahụ ma ahapụrụ ha oge eze obodo na ndị okenye obodo gboro ọgụ. E boro ebubọ na ndị ntorobịa na- emekpa ndị ọkwọụgbala na-akwọga ndị mmadụ ụka ahụ kwa mgbe Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43450019,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43450019,Darron Gibson nwetere ezumike maka oke mmanya ọ ṅụrụ,Nwụchi ndị uweojịi nwụchịrị Darron Gibson ka ọ na-anya ụgbọala oge mmanya na-egbu ya emeela ka otu egwuregwu ọ na-agbara bọọlụ bu Sunderland sị ya ga ihe ndị Bekee na-akpọ suspension.,"Darron Gibson bụ onye ala Ireland Aka na-achị Sunderland bụ Martin Bain kwuru na ha ebidoola nyocha okwu a makana ndị otu ha niile kwesiri ịkpaagwa ọfụma n'oge ọbụla. Bain kwuru sị, ""onye ọbụla nupuru isi n'iwu n'otu anyi ga-ata ezigbo ahụhụ."" Ndị uweojii Northumbria kwuru na ha jiri Gibson dị afọ 30 ugbua makana ọ ṅụrụ nnukwu mmanya. Cheta na ke mgbe ọnwa nke mbụ na afọ a, Gibson agbaghị asọmpị ọbụla makana ọnwere mmehu ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46121521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46121521,PDP ekwuola na ha amaghị ebe Uche Ekwunife kwụ ugbua,Akụkọ dị mkpa Uche Ekwunife ọ gala PDP?,"Onyeisi otu PDP n'Anambra steeti bụ Ndubuisi Nwobu, ekwuola na ya amaghị ma Senatọ Uche Ekwunife alaghachitela pati ha. O kwuru nke a maka kepu kepu na-ekwu na Ekwunife ahapụla APC gawa pati ha. Lai Mohammed o kwuru eziokwu? Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na gọọmentị ji ego karịrị nde naira atọ enye Ibrahim El-Zakzaky nri kwa ọnwa. Ndị otu El-Zakzaky bụ onyeisi ndị otu kpọrọ onwe ha 'Nigeria Islamic Movement' nke gọọmentị nwụchiri kemgbe 2015, gwara BBC na Mohammed tụrụ asị. N'ofesi, Otu nwoke agbagbuola mmadụ iri na abụọ n'obodo Califonia dị na mba Amerịka. Ndị uweojii kwuru na ndị a agbagburu na-eme mme mme ndị ụmụakwụkwọ oge nwoke ahụ batara ebe ahụ malite ịgba egbe. Leicester City N'egwuregwu, otu Leicester City ga-eyi uwe e dere aha onye isi ha nwụrụ anwụ n'asọmpi ha ga-agba na ngwụcha izuụka a. Njem nleta Ọkparaeze Charles Ọkparaeze Charles nke mba Briten bụ onyeisi otu CommonWealth wuchiri na Legọs ụnyaahụ n'ime njem nleta ọ na-eme na mpaghara Afrịka. Ndigbo nakwa ndị agbụrụ Naịjirịa ndị ọzọ bịara nabata Ọkparaeze Charles n'ụzọ pụrụiche gụnyere ịgba egwu na ihe nkiri dị iche iche. Charles kwuru na oke mgbanwe dị iche adịla na Naịjirịa kamgba afọ iri atọ gara aga ọ bịara nke mbụ. Ọnọdụ ọjọọ ọdọụgbọelu Enugwu Ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu bụ ọnya ọnwụ na-achọ onye ọ ga-ama, nke a bụ okwu Diretọ otu jikọtara ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ Simon Uchenna Ortuanya. O kwuru na ọkụ anaghị enwu n'ụzọ ebe ụgbọelu na-agba bụkwa nke nwere ohoro ma rụọ gọọmentị etiti ka ha gbata ọsọ enyemaka n'egbughi oge. Ortuanya gara n'ihu kwuo na ọdọụgbọelu a bụ ihe ndị ndọrọ ndọrọ ji achọ vootu n'aka ndị Igbo n'oge ntuliaka ọ bụla. Ndị ụkọchukwu Katọlik atọọrọ Ndị ntọ atọọrọla ndị ụkọchukwu ụka Katọlik anọ n'etiti okporoụzọ Agbor na Umutu nke Delta Steeti dịka ha si ọgbakọ na-alọta. Ndị ụkọchụkwụ a gụnyere Victor Adigboluja, Anthony Otegbola, Joseph Idiaye na Obadjere Emmanuel. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Andrew Aniamaka kwuru na nke a bụ eziokwu na nyocha ka na aga n'ihu ịmata ndị mere na etu ihe a ji mee. N'egwuregwu Manchester United si na-azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu nyụọ ndị Juventus ịkpakwụ n'ụlọ ha n'asọmpi Uefa Champịọns Ebe Manchester City nwetere mmeri ha kachasị n'asọmpi ahụ site n'ịgba ndị Shakhtar Donetsk ọkpụ isii chara acha. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Traffic Control Queen: Ndị ụgbọala Danfo na-enye m nsogbu" 43735891,https://www.bbc.com/igbo/43735891,Nnia Nwodo: Ṅomie nụ nna unu Joe Achuzia,"Mgbe akụkọ ọnwụ onye agha Biafra ma bụrụkwa dike ndị Igbo bụ Joe Achụzia batara n'obodo,owutere ọtụtụ mmadụ mana ha kasiri onwe ha obi maka ụdiri ndụ o biri.","Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 Tumadị na imee ka ndị Igbo nwere onwe ha. Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha. O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ. Ndị agha Biafra Nwodo gwakwara ndị Igbo na ike agwụla ha n'ime ndọrọndọrọ maka ị nweta ọnọdụ ọma n'ala dimma ebe ndị obodo ahu ga-enweta ikike nhataha n'agbanyeghị ebe ha si. O kwuru na ha mee nke a, na ọ ga bụ nnukwu nkwanye ugwu dinyere Achuzia. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-46570875,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46570875,BBC African Footballer of the Year 2018: Mohammed Salah atụrụla ugo,"Onye na-agbara Liverpool bọọlụ bụ Salah atụrụla ugo dịka ""Ọkacha Agba Bọọlụ n'Afrịka 2018"" nke BBC na-aghazi.","Salah dị afọ iri abụọ na isii, tụtara ugo dịka ọkachasị enye goolu n'asọmpi English Premier League. O nyere goolu niile ndị Ijipt nwetere n'asọmpi Iko Mbaụwa - nke bụ pasentị iri anọ n'asọmpị ha niile n'Iko Mbaụwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53740079,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53740079,Stella Damasus ekwuola etu o si malite ịza Damasus,Omee ihe onyonyo nke bụ Stella Damasus akụwaala akụoyibo nsugbe na mkaprịtaụka ya na BBC Igbo nwere.,"Mgbe a jụrụ ya ihe mere aha nna ya ji bụrụ 'Damasus', ọ kọwara na ọ bụ n'oge agha Biafra ka nna nna ya gbanwere aha ya iji gbalahụ ọnwụ n'aka ndị agha Naịjirịa. ""Aha nna nna m bụ Ojukwu mana ndị agha Naịjirịa nụrụ ya ha echee na ọ bụ ezinaụlọ Odimegwu Ojukwu ka anyị si, ya mere o jiri gbanwee ya"", ka ọ kọwara. Lee ihe ndị ọzọ ọ gbara ama maka onwe ya ebe a. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju ebe a" afirika-46754306,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46754306,Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka,Ihe gbasara ahụike ụbụrụ abụghị ihe dị mfe maọbụ ihe anya hụrụ,Kama na otu dọkịta n'ihe gbasara ahụike nke uche mere ka anyị mata na ọ bụghị naanị ihe a na-ahụ anya nwere ike ịrịa mmadụ O kwukwara ụzọ ị ga-esi nyere ndị nọ na nsogbu aka. afirika-47708408,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47708408,Certificate of Return: APC akwọpụla aka n'isi Rochas?,Odee akwụkwọ pati APC bụ Lanre Isa-Onilu agwaala ndị ntaakụkọ na ha agaghị enyerenwu Rochas Okorocha aka ịnwete asambodo mmeri ya.,"Rochas Okorocha nọ n'agba nke abụọ dịka Gọvanọ Imo steeti Ọ kwuru na ọ bụ maka na ha kwụsitụrụ ya ọrụ mere na ya bụ Okorocha enwebeghị ọnụ ịbia kpesara pati ahụ ihe gbasara asambodo mmeri ya. Onilu kwuru na ọ bụrụ na nkwụsị ọrụ Rochas bie, pati etinye ọnụ n'okwu ya. Cheta na Inec jụrụ ịnye Rochas Okorocha asambodo mmeri ya n'ụlọomeiwu ukwu maka ebubo imagide onye ọrụ Inec dịka onye meriri ntuliaka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 52553470,https://www.bbc.com/igbo/52553470,"Ngozi Okonjo-Iweala: ""Ala Igbo nwere ihe niile iji kwalite akụnụba Naịjirịa n'oge coronavirus a""",Anyị enweghikwa ndị ga-azụ mmanụ agbịdị anyị.,Ọ kara anyị mma na anyị chọrọ etu anyị ga-esi rụpụta mmanụ anyị ka anyị na-ere ya ka ọ na-amịpụtara anyị ego. Ọ kpọkuru ndị ụlọakụ nke ukwu ka ha tinye aka kwalite azụmahịa ndị mmadụ na Naịjirịa n'inye aka ka akụnụba Naịjirịa kwukwara ọtọ ọzọ. media-45624367,https://www.bbc.com/igbo/media-45624367,Buhari chọrọ ịkwụ ndị ruburu na Nigerian Airways ụgwọ ezumike nka,Akụkọ kachasị mkpa taa: Ego Buhari mapụtara,"Mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa, kwuputara na Onyeisiala Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ maka inye ndị mahadum gọọmentị ijeri naịra iri abụọ ozugbo ozugbo ka ha nwee ike kuru ume ọhụrụ. End of Twitter post, 1 O kwukwara ka e wepụta ijeri naịra iri abụọ na abụọ (N22billion) iji kwụọ ndị rụburu na ngalaba ụgbọelu Nigerian Airways Limited ụgwọ ezumiike nka ruru ha. Ụgwọ a Buhari kwuru ka a kwụọ ndị ọrụ ụgbọelu a na-abịa ka afọ 15 emechiri ngalaba ahụ gachara. Cheta na n'afọ 2017, Hadi Sirika bụ mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu kwuputara na Onyeisiala Buhari kwere nkwa ịkwụ ụgwọ a. Ijeri naịra 22 a Buhari kwuru ka a kwụọ bụ naanị pasentị 50 dị n'ime Ijeri naịra 45 gọọmentị kwenyeburu na a ga-akwụ n'ime Ijeri 78 ndị ọrụ ahụ gwaburu gọọmentị ka ha kwụọ. Zainab Shamsuna Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa kwuputara ozi a n'akara Twitter ya. Buhari na UNGA N'akụkọ yiri ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari na nwunye ya atụla ụkwụ n'obodo New York ebe ọ ga-ekwu okwu n'ọgbakọ United Nations General Assembly n'ụbọchị Septemba 25 nke 2018. Na mba ofesi, Ndị Rọshịa ekwuola na ha ga-ezigara ndị mba Sịrịa ngwaagha ga-ekpuchitere ha ụgbọelu ha. Nke a na-abịa ka ndị mba sịrịa gbaturu otu ụgbọelu mba Rọshịa n'amaghị ama n'izu gara aga oge ha na mba Izrel na-akwata ya. N'egwuregwu, Ihe ọma emeela n'ụwa egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị ka achọrọ ibido inye ha ihe nturugo Ballon d'or maka nwaanyị kachasị agba bọolụ. A ga-enye nke mbụ na ngwụcha afọ 2018 a. Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Saraki etinyela ọnụ na mkpebi ntuliaka Osun Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dere na soshal midia na echiche ya bụ na INEC emeghi nke ọma maka mkpebi ha mere banyere ntuliaka ịhọpụta govanọ Ọshụn steeti e mere ụbọchị ole gara aga. Mana ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe o kwuru, makana ha sị na ọbụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme, ma kwukwa na usoro ya dị n'iwu Naịjirịa. Ihe mere senate ji dọtịa ụbọchị mmepe ha Ụlọọmeiwu ukwu agaghị emepe na Septemba 25 ka ha siri kwu na mbụ. Ode akwụkwọ ụlọọrụ a bụ Mohammed Sani-Omolori, kwuru na ha mere mkpebi a maka ntuliaka imeụlọ na-eme ugbua n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasị n'ime ụlọomeiwu ugbua. Achọpụtala ndị atọrọ n'oke osimiri Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ ụgbọmmiri na Naịjirịa ekwuola na ha amatala aha mmadụ iri na abụọ ahụ ndị omekome tọrọ na oke osimiri dị n'akụkụ Naịjirịa. Ha kwuru na mmadụ asaa n'ime ha si mba Philippines ebe mmadụ ise ndị ọzọ si mba Slovenia, Ukraine, Romania, Croatia na Bosnia bịa. Cheta na a toro ndị a ebe ha si Port Harcourt na-aga Legọs n'ụbọchị Satọde gara aga. Toonu Tiger Woodsdike! N'egwuregwu, Ọ fọdụrụ obere ka Tiger Woods bee akwa n'ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba, 2018. O nwetara mmeri n'asọmpi 'Tour Championship' nke mere n'Atlanta USA. Nke a mere ya nke mbụ kemgbe o na-enweta mmeri ọbụla n'egwuregwu golf kemgbe afọ 2013. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo" egwuregwu-43015009,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43015009,Lagos City Marathon: Abraham Kiprotich emeriela,"Ka ọ kwadoro inye ndị meriri n'ọsọ a ihe nrite, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode kwuru sị ""ike agwụla anyị inye ndị si n'ọwụwa-anyanwụ Afrịka ihe nrite a.","Ma onye ukwu, ma onye nta so gbaa ọsọ a ""Anyị ga-ebido itinye uju n'ịzụ ndị Naịjirịa ka ha nwee ike imerinwu maratọn."" Kemgbe ebidoro ịgba ọsọ Lagos City Marathon afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị sị ọwụwa-anyanwụ Afrịka na-emeri. Ihe ruru mmadụ puku otu narị sonyere na-ịgba ọsọ Lagos City Marathon nke 2018 nke bidoro ụzọ ụtụtụ taa. Ndị mmadụ bidoro ịhapụwa ụlọ ha ebe elekere ise nke ụtụtụ, ebe ụfọdụ pụtara ka ndị ọsọ na-agbafe n'agbataobi ha. Lekwa ihe ndị pụrụiche BBC hụrụ: End of Twitter post, 1 Nwaanyị yi uwe ndị Hausa a na-akpọ Hijab sokwa gba ọsọ a Ụfọdụ na-achọghị ịgba ọsọ ji ịnyịnya igwe ha sonye Ụfọdụ ndị nwere ọlụsị sonyekwara Ụfọdụ ndị ọcha sokwa gbaa ya bụ ọsọ Ụfọdụ ndị wepụtara onwe ha maka inyere ndị ihe merụrụ ahụ aka Otu onye so agba ọsọ kwụsịrị izu ike Okocha gbaburu Naịjirịa bọọlụ sokwa gbaa ya bụ ọsọ" afirika-45319232,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319232,Inec si na-onweghi mgbagwoju anya ọbụla di na bọjeti ha,Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:,"Inec Inec na-akwado ntuliaka 2019 Independent electoral commission akpọrọ INEC na aha ịchafụ agọọla na-onweghị ihe nzuzo di na ego ha tinyere maka ntụlịaka 2019. Ode akwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Rotimi Oyekanmi siri na kama, onyeisiala Mohamadu Buharị kere ya bụ ego ezigara ya ụzọ abụọ maka ịwepụta ya. Okwu Restructing Igwe Alfred Nnaemeka Achebe bụ obi na ọnisha akpọọla oku ka ndị Igbo tinye ọnụ na ihazigharị obodo Naịjirịa karịa ịzọ ọkwa ọnyeisiala. O kwuru nke a n'ihụ gọvanọ plateu steti bụ Simon Lalong mgbe ọ gara ịnọnyere ndị Anambra na Jos na-emume ụbọchị omenala ha na ebe ahụ. Na mba ofesi Ihe a mere na ọgbọ egwuregwu GLHF Game Bar dị Jacksonville, Florida Ndị uweojii n'obodo Florida na mba Amerika ekwuola na otu nwoke gburu mmadu abụọ na ebe a na-eme asọmpị ihe nkiri Bekee Kpọrọ Video Game. Nwoke a mechara gbuo onweya ka ndị hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa na ọ bụ mgbe emeriri ya ka nwoke a kopuru bịa were mgbọ sawa ndi mmadụ ahụ. Ndị merụrụ ahụ nọ ụlọụgwụ. Na egwuregwu Ọgbọ egwuregwu Arthur Ashe Ndị ọkwa ha gbagotere na egwuregwu tenis ga-ezute taa na mgba Amerịka maka asọmpị akpọrọ US open na Bekee. Mmadụ dị ka Andy Murray, Serena Williams, Rafael Nadal, Stan Wawrinka na Sloane Stephens ga eso zụọ iko nke afọ a. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụkọchukwu Jenny Kenny gwara BBC Igbo na ọ bụ chukwu kpọrọ ya oku, nke mere ya ji jiri egwu agwọ ọrịa. Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia" afirika-46410604,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46410604,World AIDS Day: 'A rịala m ọrịa HIV/AIDS ruo afọ anọ ka kwụrụ chim',"Ụbọchị December 1 nke afọ ọbụla bụ nke ngalaba ahụike mba ụwa ji eme ncheta agha a na-ebuso HIV gụnyere mgbochi ya, nyocha ya, nlekọta ọgwụgwọ ya, dgz.","Dịka ngalaba World Health Organisation si depụta, ncheta nke afọ 2020 na-ebu aka maka mkpa mkpa covid na-akpa na mba ụwa niile mana a na-aja ndị nọ n'ihu agha a ike. Otu onye rịagoro ọrịa site n'afọ 2014 ruo afọ 2018 gwara BBC ka o si were ọnọdụ a na-enyere ndị mmadụ aka site n'ịgwa ha okwu nkasiobi nakwa ihe ha ga-eji ndụ ha mee n'ọnọdụ di etu ahụ. O kwukwara na mgbe ọ chopụtara na ọ na-arịa ọrịa a, ọ maghị ka ọ ga-esi gwa nne na nna ya. Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a. Isiokwu #WorldAIDSDay nke afọ 2018 bụ ""mara ọnọdụ gị"". Ọtụtụ ngalaba ahụike mbaụwa ekwuola obi ha gbasara ncheta ụbọchị HIV/AIDS. Otu n'ime ha bụ World Health Organisation. Ha kwuru na otu onye n'ime mmadụ anọ ọbụla na mbaụwa niile nwere ọrịa HIV/AIDS mana ha amaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44848677,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44848677,Mobil na-akpaso anyị agwa ka ndị amaghị oke ruru ha - Ndị a chụrụ n'ọrụ,"Kemgbe ụbọchị Fraịde nke izuụka gara aga, ndị na arụbụ ka ndị nchekwa n'ụlọọrụ ExxonMobil gbachiri ụzọ isi ụlọọrụ ahụ na Legọs ebe ha na-eme ngagharị iwe maka ihe ha kwuru bụ mmegide ekwesịghị ekwesị e mere ha.","Ndị ọrụ Exxon Mobil ebeela akwa arịrị Ihe ruru mmadụ otu narị na ọma gwara BBC na n'agbanyeghi na ụlọikpe ukwu gwara ExxonMobil ka o mee ha etu e kwesịrị ime ndị na-arụrụ ha ọrụ, ụlọọrụ ahụ kachiri ntị chụọ ha n'ọrụ. Onyeisi ndị na-eme ngagharị iwe bụ Stephen Ashemudaga, gwara BBC Igbo na ndị nọ ngagharị iwe a bụ ndị nọ ọrọ na Legọs. O kwuru na e were ha n'ọrụ na Mobil, na ọ bụghị uweojii ka ha bara. ""Mana, ka anyị batara, ndị Mobil zigara anyị ka anyị gawa ọzụzu n'ụlọ akwụkwọ ndị uweojii Naịjirịa, makana ha sị na ha chọrọ ka anyị yie uwe ndị uweojii iji chekwaa ha ọfụma,"" Ashemudaga kwuru. Ọ gara n'ihu kwuo na Mobil mechara sị ha na ha bụ uweojii, mana ndị uweojii gwara ha na enweghi etu ha si bụrụ ndị otu ha makana ha eweghị ha n'ọrụ. Na nkọwa ya, ihe ha ji gbachie ụlọọrụ Mobil bụ ka ha nye ha ihe ruru ha. Akụkọ ndị ga-amasị:" afirika-46254136,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46254136,Alvan Ikoku: Ihe ise ị kwesịrị iji cheta ya,"Ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 2019, ga-eme ya afọ 48 Alvan Ikoku nwụrụ, mana kedụ ihe ị ma maka ya?","E biri foto Alvan Ikoku n'ihu ego N10. Alvan Ikoku so na ndị Igbo ji eme ọnụ, ya bụ ndị ọ ga-abụ akpọwa aha ndị Igbo bụ isi a hụrụ kwaba okpu ghara ịkpọ aha ya, a mara na ihe emebiela. Nke a mere BBC ji chọọ icheta nwoke a n'ụbọchị ọ nwụrụ n'afọ 47 gara aga. Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-54191158,https://www.bbc.com/igbo/media-54191158,Ihe Wike na Obaseki kwuru maka Obaseki ịlaghachi APC,Gọvanọ Edo steeti bụ Godwin Obaseki ekwuola na ya agaghị ahapụ PDP bụ pati nabatara ya mgbe APC bụbu pati ya gbakụtara ya azụ..,"Nyesom Wike: A jụrụ m Godwin Obaseki ma ọ ga-ahapụ PDP... Obaseki gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Fraide oge ọ gara ikele onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari n'Obi Gọọmenti Etiti dị n'Abuja na-ọ ga-abụ arụ ịlaghachị APC. Ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ uche na dịka o merichara Osagie Ize-Iyanmu na ntuliaka, na ọ ga-alaghachi n'otu APC, mana ọ sị na ọ gaghị eme eme. Cheta n'ụtụtụ taa, Wike kwuburu na mkparịtaụka ya n'ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na Obaseki agaghị ahapụ PDP gawa APC n'ihi na ""APC abụghị Pati"" O si na ọ bụ ""PDP yinyere ya (Obaseki) akwa ma nye ya ochendo oge mmiri na-ama ya."" ""APC abụghị otu ndọrọndọrọ ọchị. Ha bụ ndị gabkọrọ aka ịnapụ PDP ike ọchịchị. Ya butere nsogbu ha na-enwekọrịta ugbua."" ""Ha bụ ndị gbakọtara kpaa nkata megide Goodluck Jonathan."" Inec enyela Godwin Obaseki asambodo mmeri dịka Governor Edo state Ngalaba ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) enyela Godwin Obaseki na Phillip Shuaibu asambodo mmeri dịka Gọvanọ na osote Gọvanọ Edo steeti. Onyeisi Inec n'Edo steeti bụ May Agbamuche-Mbu nyere ha asambodo a nke a kpọrọ 'Certificate of Return' na bekee, n'ụbọchị Tuzde. O kwuru sị: ""A na m ekwupụta taa na Godwin Nogheghase Obaseki onye otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' emeriela ntuliaka dịka gọvanọ nke Edo steeti bụ nke e mere n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2020."" Obaseki meriri Osagie Ize-Iyamu onye pati 'All Progressives Congress' na ntuliaka ahụ. Ihe mere m ji soro ndị Edo na-anụrị maka mmeri Obaseki na ntuliaka Edo 2020 - Okorocha Rochas: Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ na-ekele ndị Edo steeti maka etu ha si tunyere Godwin Obaseki meriri ntụliaka ọkwa gọvanọ a ka mere ụnyahụ na steeti ahụ. Okorocha onye kwuru na ọ naghị ekele pati ọbụla si na ọ dị mma ka ndị Edo si pụta tunyere onye ha bu n'obi. O kwukwara na nke a gosiri na ha jịkọrọ aka buso mmegide dị na steeti ahụ. O kwuru na mgbe ọ hụrụ Adams Oshiohmole, Hopoe Uzodimma nakwa ndị ọzọ ka ha na-achụ nta vootu na steeti ahụ tupu ntụliaka , ka ọ nọ wee mara ọ ga-abụ ""Ben Johnson"" maọbụ enweghị mmeri ga-adịrị onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ na steei ahụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal maka okwu Rochas Okorocha gbasara ntụliaka Edo steeti Onyonyo gosiri okwu ndị a Okorocha kwuru gbasara ntụliaka Edo. Akụkọ na Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntuliaka Edo bụ ụgha- Ọnụ na-ekwuchitere ya Onye mgbasa ozi gọvanọ Imo steeti bụ Nwachukwu Oguwike ekwuola na akụkọ na-ekwu na Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntụliaka Edo bụ okpotokpo asị. O kwukwara na akụkọ kwuru na gọvanọ Uzodimma tụnyere ego ruru ijeri naira atọ bụ asị. O kwuru na ndị na-ede akụkọ ụgha a chọrọ itetọ aha gọvanọ Uzodimma na ihe niile o kwenyere na ya. Oguwike kwuru na mbọ niile a na-agba site n'ịkọ akụkọ ụgha a bụ ka ewepụ uche Uzodimma n'ọrụ ọ na-arụrụ ndị Imo steeti mana nke a agaghị abịa na mmezu. Na mbụ, akụkọ fegharịrị n'elu soshal midia na gọvanọ Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntụliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Edo steeti ma na-akpọ ya ihe ihere. Lee mpụtara ntuliaka Edo 2020 ""A ga m enyocha mpụtara ntụliaka Edo steeti"" - Osagie Ize-Iyamu Osagie Ize-Iyamu nke APC ekwuola na ọ ka na-etinye anya na mpụtara ntuliaka a, tupu o kwuo ihe ọzọ ọ ga-eme. Ize-Iyamu nwetara vootu 223,619 iji bụrụ onye nke abụọ a kacha tụnyere vootu na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Edo steeti, kelekwara ndị kwadoro ya. Onyeisiala Buhari ekeleela Gọvanọ Obaseki maka mmeri ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela Gọvanọ Godwin Obaseki ụkpa ekele maka imeri ntuliaka ya n'Edo steeti. N'agbanyeghi na Onyeisiala Buhari bụ onye pati APC bụ ebe Obaseki si banye PDP tupu e mee ntuliaka, o kwuru na ihe kacha ya mkpa bụ na ntuliaka na-aga nke ọma na-ebughi ọgbaghara ọbụla. Ụkpa ekele esila n'elu na ala na-awụbatara Gọvanọ Obaseki maka mmeri ya Ndị mmadụ amalitela ikele Gọvanọ Godwin Obaseki maka ịzọta oche ọchịchị Edo steeti ọzọ. Ndị gụnyere Atiku Abubakar zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019 na Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo steeti so na ndị bunyere Obaseki ụkpa ekele. Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas steeti, Sinetọ Ike Ekweremadu na-anọchite ndị Enugwu West n'ụlọomeiwu ukwu, Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti, so na ndị so ya na-enwe aṅụrị maka mmeri ya. Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka mmeri ya: Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ dị mma na ọchịchị onyekwuouche ya mezuru n'Edo steeti, n'agbanyeghi na ọ bụghị ha meriri. Ihe ndị ọzọ kwuru: Obaseki ejirila mmeri kụpụta Ize-Iyamu ọnụ ikputu ọzọ Gọvanọ Godwin Obaseki enwetela ikike ịchị Edo steeti afọ anọ ọzọ dịka o meriri ntuliaka ọzọ. Ka o merichara, o kwuru okwu maka etu o si nabata mmeri ya, ma kelee ndị tụnyere ya vootu mere ka o nwee ike ịchị ọzọ. Obaseki nọ n'okpuru pati PDP, nwetara vootu 307,955 iji bụrụ onye mbụ, ebe onye na-eso ya n'azụ bụ Osagie Ize-Iyamu nke APC nwetara vootu 223,619. N'ime mmadụ 557,443 e nyere ikike ịtụ vootu, a tụrụ vootu 550,242. ebe 537,407 n'ime vootu ndị a atụrụ dị mma, 12,835 adịghị mma. Ihe ndị ọzọ tụtara: APN: 57, APP: 78, LP: NNPP: 258, NRN: 573, 267, SDP:323. Ọkammụta Akpofure Rim-Rukeh bụ onye mkpokọta gụpụtara mpụtara ndị a. Lee etu mpụtara ntuliaka n'Edo steeti si gaa A malitela ịgụ vootu n'Edo ka ụfọdụ ebe tụchara vootu Amalitela ịgụ vootu n'ụfọ ọdọ ntuliaka n'Edo site dịka ndị mmadu binyechara aka n'akwụkwọ iji họta onye ga-achị ha dịka gọvanọ ruo afọ anọ. Lee etu mpụtara ntụlịaka Edo site na mpaghara si kwuru Mpụtara n'Orhionmwon bụ okpuruọchịchị ebe Ize-Iyamu si Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 118671 Ndị nwereikike ịtụ Votu: 24868 Mmadụ ole tụrụ Votu: 24213 APC: 10458 PDP: 13445 Akagburu vootu mmadụ 7600 na wọọdụ 7, kagbuo 7896 na wọọdụ 8 maka ọgbaghara dapụtara mgbe ha na-eme ntụliaka. Mpụtara mpaghara Estako Central LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 50004 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 16092 Mmadụ ole tụrụ Votu: 16042 APC: 8359 PDP: 7478 Mpụtara mpaghara Estako East LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 157291 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 28464 Mmadụ ole tụrụ Votu: 27824 APC: 17011 PDP: 10668 Mpụtara mpaghara Akoko Edo LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 121027 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 46967 Mmadụ ole tụrụ Votu: 43994 APC: 22963 PDP: 20101 Mpụtara mpaghara Esan Central LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 55569 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 17931 Mmadụ ole tụrụ Votu: 17914 APC: 6719 PDP: 10794 Mpụtara mpaghara Igueben LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 46828 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 13404 Mmadụ ole tụrụ Votu: 13382 APC: 5199 PDP: 7870 Mpụtara mpaghara Ikpoba Okah LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 310073 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 61731 Mmadụ ole tụrụ Votu: 61,430 APC: 18218 PDP: 41030 Mpụtara mpaghara Esan North LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 84741 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 20825 Mmadụ ole tụrụ Votu: 20369 APC: 6556 PDP: 13579 Mpụtara mpaghara Uhunmwode LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 73416 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 16741 Mmadụ ole tụrụ Votu: 16635 APC: 5972 PDP: 10022 Mpụtara mpaghara Esan west LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 99983 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 25530 Mmadụ ole tụrụ Votu: 25459 APC: 7189 PDP: 17434 Mpụtara mpaghara Oredo LGA ( Ebe Gọvanọ Obaseki si) Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 309968 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 64783 Mmadụ ole tụrụ Votu: 63880 APC: 18365 PDP: 43498 Akabgụrụ mpụtara na ward 7 na ward 2 maka nrụrụaka na ndị bu agbata votu gbaa ọsọ. Mpụtara mpaghara Esan South LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 73907 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 19896 Mmadụ ole tụrụ Votu: 20203 APC: 9237 PDP: 10563 Akagburu mpụtara ward 1, ward 2 na ward 10 maka nrụrụaka Mpụtara mpaghara Estako West LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 158899 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 48846 Mmadụ ole tụrụ Votu: 47367 APC: 26140 PDP: 17959 Mpụtara mpaghara Ovia North East LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 143009 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 28607 Mmadụ ole tụrụ Votu: 28371 APC: 9907 PDP: 16987 Mpụtara mpaghara Owan West LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 61193 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 23294 Mmadụ ole tụrụ Votu: 23253 APC: 11193 PDP: 11485 Mpụtara mpaghara Owan East LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 91769 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 34819 Mmadụ ole tụrụ Votu: 34761 APC: 19295 PDP: 14762 Mpụtara mpaghara Egor LGA Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 219841 Ndị nwereikike ịtụ Votu : 39709 Mmadụ ole tụrụ Votu: 39351 APC: 10202 PDP: 27621 Ezupuru akpati votu na Ogidi Ward 3 na unit 4,5 na 18 Ọgbaghara ọ dapụtara n'Edo steeti? Kepu kepu malitere ifegharị na soshal midia na a na-agba egbe n'ụfọdụ akụkụ Edo steeti n'ihi ntuliaka a. Mana mgbe BBC kpọtụrụ Joseph Imafidon bụ onyeisi ndị uweojii na mpaghara Iguododo na gburugburu ya, o kwuru na enweghi ihe dị etu ahụ mere. Ndị ntaakụkọ BBC nọkwa na Benin kwuru sị na ha anụghị ụda egbe maọbụ ọgbaghara ọbụla. Obaseki na Ize-Iyamu emeriela n'ọgbọ ntuliaka ha Gọvanọ Godwin Obaseki emeriela n'ọgbọ ntuliaka ya bụ wọọdụ 4 unit 19 dị na Emokpae Primary School. N'ime vootu 246 a tụrụ, o nwetara vootu 184 ebe Osagie Ize-Iyamu nke APC na-eso ya n'azụ nwetara vootu 62. Ndị ọzọ bụ ADP nwetara abụọ ebe LP nwetara naanị otu, ebe a gụfuru vootu ise. Akwụkwọ e ji edekọ vootu ole a tụnyere Ebe Ize-Iyamu meriri na wọọdụ ya bụ wọọdụ 5 unit 26 dị na Iguododo Primary school. O nwetara vootu 292 ebe Obaseki nke PDP nwetara vootu 21. Ndị mmadụ nọ ebe ha nọ tụọ vootu na-eche ka a gụọ vootu ma mara onye kacha nwete vootu tupu ha alaa, dịka ha chọrọ ịchekwa vootu ha. Ndi mmadụ na-eche ka agụọ vootu ha Obaseki sị na obi adịghị ya mma maka agwa Inec na ntuliaka Edo Obaseki sị na ya nọ n'anwụ ruo otu awa n'ọkara tupu o tụọ vootu Gọvanọ Godwin Obaseki ekwuola na obi adịghị ya mma ebe ngalaba ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nọ, maka na ha akwadoghi ntuliaka a ọfụma. Ọ sị: ""E nweburu m nchekwube na Inec ga-akwado ọfụma maka ntuliaka. Anọ m ruo otu awa na ọkara tupu m tụọ vootu. Ọ bụ ihe iwe."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na dịka ntuliaka a bụ nke otu ụbọchị, ya che na Inec ga-akwado ọfụma. Ọ dịghị mma n'obi ma ncha."" Ọ sị; ""Kaadị njirimara ndị tozuru ịtụ vootu nọ na-akpụ akpụ ebe ọbụla. Adams Oshiomhole sokwa kwụrụ n'ahịrị Aka chụbụru Edo steeti bụ Adams Oshiomole sokwa pụta ịtụ vootu ma kwụrụ n'ahịrị Adams Oshiomhole bụbu onyeisi pati APC nakwa gọvanọ Edo steeti kwukwara na ọ bụghị ihe ọma na igwe kaadị reader anaghị arụ ọrụ ebe ọ nọ, ma kwuo na Inec na-agharịpụ ha maka akwadoghi ọfụma. Cheta na Oshiomhole chịrị Edo steeti afọ asatọ tupu Obaseki abanye ọchịchị. Ize-Iyamu ahapụla obodo ya gawa Benin ka ọ tụchara vootu Onye na-azọ ọchịchi n'okpuru pati APC bụ Osagiue Ize-Iyamu ahapụla obodo ya gawa Benin dịka o tụchara vootu. Ize-Iyamu tụrụ vootu n'obodo ya bụ Iguododo dị na mpaghara Orhionmwon. Ize-Iyamu na onyeisi ndị uweojii no ọrụ nchekwa n'obodo ya Tupu ọ hapụ obodo ya o kwuru na ntuliaka, dịka ya siri hụ ya, na-aga nke ọma. Mana, ka ọ pụrụ, nhazi niile emere maka mgochi coronavirus hasara dịka ndị mmadụ kwụsịrị ị nọ na nkwụcha. Ndị na-atụ vootu n'obodo Iguododo dị na mpaghara Orhionmwo Obaseki na nwunye ya atuọla vootu Godwin Obaseki na nwunye tụrụ vootu nke ha n'Emokpae Model Primary dị n'Oredo. N'agbanyeghị na ndị mmadụ na-asịbu ya gafee n'ihu, Obaseki si na ya ga-em ka ndị ọzọ ma nọrọ n'anwụ ruo mgbe oruru oge ya ịtu vootu. Mm,adu karịrị, dịka anwụ na-achasị ike mana oge nke ha ruru ha nwere tụọ vootu. Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki na nwunye ya kwụ n'ahịrị dịka ha bịara ịtụ vootu n'ụlọ akwụkwọ Emokpae Model Primary dị n'Oredo. Ọgbaghara adaala dịka Obaseki bịara ịtụ vootu n'obodo ya Dịka Obaseki bịara ebe a na-atụ vootu n'Emokpae Model Primary School ọgbaghara malitere dịka eboro otu onye ebubo na ọ chọrọ itisa ebe ahụ. Ndị mmadụ nọ ebe ahụ kpụpụrụ onye ahụ yi uwe ojii tupu ọgbaghara o bu bịa akarịa Obaseki n'onwe ya atụbeghị vootu dịka ọ ka nọ n'ahịrị eche oge oruru ya. Obaseki ekweghi ịhapụ ịkwụ na-ahịrị, si na ọ ga-anọ ruo mgbe oge ya ruru ịtụ vootu. Mmadụ ka nkụ na-ebe ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-aba mba na ahịrị adịghị aga ma ncha. Ọbaseki siri ọnwụ na ya ga-akwụ n'ahịrị dịka ndi ọzọ Ize-Iyamu atụọla vootu nke ya Osagie Ize-Iyamu tụrụ vootu ya na obodo ya bụ Iguododo dị na mpaghara Orhionmwon. Ka ọ tụchara vootu, Ize-Iyamu kwuru na ụmụnwaanyị na-aka ụmụnwoke atụ vootu na be ha. Nke a bụ iji saa ajụjụ ihe mere na ụmụnwoke karịrị ụmụnwaanyị. Ọ sị: ""Ụmụnwaanyị na-atụsị vootu ike ebe. Ha ka ga-apụta. Ụfọdụ n'ime ha ga-aga ugbo tupu ha a bịa ịtu vootu."" Ọ bụ na Emokpae Model Prinary School dị n'okpuru ọchịchi Oredoka Gọvanọ Godwin Obaseki ga-atụ vootu nke ya Ndị mmadụ amalitela ịtụ vọọtụ Amalitere ịtụ vootu n'Edo ọsọ ọsọ dịka a na-achọ ịhọpụta onye ga-achị Edo steeti. Lee etu o si aga: Ndi ntaakụkọ BBC na-ekwu na ndị mmadụ na-atụ vootu n'udo dịka ndị ọru nchekwa nọkwa ọrụ Ndị mmadụ amalitela ịkwụ n'ahịri maka ịtụ vọọtụ n'Edo Ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ ka ndị mmadụ maliterea ịkwụ n'ahịrị maka ịtụ vootu a ga-eji họpụta aka ga-achị Edo steeti. Ndị ntaakụkọ BBC nọ n'Edo na-ezita foto na-egosi etu o si aga Ndị ọrụ Inec na-ebe Ize-Iyamu ga-atụ vootu Exchefughi na covid-19 ka na-akpa mkpa na Naịjirịa. Lee ihe eji anyụcha aka Inec dewere n'ebe a na-atụ vootu Akpati eji atụ vootu adịrịla njikere A na-enyocha ndị mmadu ahu maka mgbochi coronavirus Ndị ọrụ Inec adịrịal njikere na ọdọ vootu a Ọ bụ mmadụ nde 1.7 tozuru ịtụ vootu n'Edo Ihe a bụ ugboro abụọ mmadụ abụọ a ga-achịpụ ya n'Edo, mana ha tụgharịrị pati iji mee ya Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuru ọ bụ mmadụ nde 1.7 tozuru ịtụ vootu a ga-eji họpụta aka ga-achị Edo steeti na ntuliaka Satọde. Ọ bụ mmadụ 2,210,534 denyere aha ha n'akwụkwọ maka ịtụ vọọtu mana ọ bụ sọsọ 1,726,738 nwetere caadị njirimara ndi tozuru ịtụ vootu. Ọ bụ okpuru ọchịchị ime obodo 18 dị n'Edo, nke nwere ebe a ga-anọ tụọ vootu 2,627. N'ime ndị a denyere aha ịtụ vootu, ụmụnwaanyị dị 1,051,209 ebe ụmụnwoke dị 1,159,325. Ọ bụ pati 15 so azọ oche gọvanọ a mana ọbụ Peoples Democratic Party (PDP) na All Progressives Congress (APC) ka ọtụtụ che bụ ndị nwy ha bụ ndọrọndọrọ ọchịchị. Aka na-achị steeti ahụ bụ Godwin Obaseki nọ na PDP ebe Osagie Ize-Iyamu nọ na APC. Na ntuliaka nke e mere 2016, Ize-Iyamu zọrọ ọchịchi n'okpuru PDP ebe Obaseki ji ọkọrọtọ APC merie. Ndị uweojii karịrị 300 awakpoola ụlọndina ebe Gọvanọ Nyesom Wike nọ n'Edo steeti Aka na-achị Rivas steeti bụ Gọvanọ Nyesom Wike etiela mkpu dịka ọ na-ekwu na ndị uweojii karịrị narị atọ chere ya aka mgba n'ụlọndina ebe ọ nọ n'Edo steeti. Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Wike onye nọ ọrụ dịka onyeisi ndị na-achụmnta vootu ndị pati ya bụ People's Democratic Party (PDP) kwuru na a na-egbochi ya na ndị gọvanọ ibe ya, ịrụ ọrụ ọ bịara ịrụ na steeti ahụ. O tiri mkpu sị na e ji ndị uweojii ndị a na-adọkasị ha ahụ, iji tinye ha ụjọ n'ahụ. N'otu aka ahụ, PDP na onwe ha eziputala akwụkwọ mkpesa ebe ha kọwara etu ndị ọrụ nchekwa si nọgide ndị gọvanọ nọ na pati ha n'Edo steeti. Cheta na echi bụ Satọde, Septemba 19 bụ ụbọchị ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ. Onyeisi ndị uweojii amachiela ngagharị ụgbọala n'Edo n'ihi ntuliaka Satọde Onyeisi uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu, enyeela iwu na agaghị enwe ngagharị ụgbọala bido n'Elekere 11:59 nke abalị Fraide rue ELekere isii nke mgbede Satọde. N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mbah binyere aka, o kwuru na ya bụ ntuziaka bụ iji hụ nae gbochiri nfesa ngwaọgụ maọbụ ọgwụ ike nakwa ịhụ ihe niile gara n'anya ya n'oge ntuliaka. Cheta na ndị uwe ojii ziburu ndị uweojii ruru popuku iri atọọ n'Edo maka ntuliaka ahụ. Ihe mberede okporoụzọ adakwasala ndị ọrụ 'Daar Communication' na-aga Edo steeti maka ntuliaka Ndị ntaakụkọ sị n'ụlọọrụ 'Daar communications' adanyela n'ihe mberede okporoụzọ ụbọchị Tozde dịka ha na-aga Edo steeti maka Ntuliaka Gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ na ngwụcha izu. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na mmadụ atọ n'ime ha merụrụ ahụ dịka ọdachi ahụ zutere ha n'Auchi. E bugara ndị merụrụ ahụ n'ụlọ ọgwụ a kpọghị aha ya maka nleta. Otu onye ọrụ AIT achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na onweghị onye tufuru ndụ ya na ihe mberede ahụ. O kwukwara na e bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ ebe ha natara nleta ma gaa n'ihu na njem ha. Inec amalitela ikesa akọrọngwa a ga-eji mee ntuliaka n'Edo steeti Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka ba Naijria bụ 'Independent Electoral Commission' (Inec), amalitela nkesa akụrụngwa dị oke mkpa maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo state. Cheta na ntuliaka a ga-adị n'ụbọchị Satọde, abalị iri na itoolu nke afọ 2020. Akụrụngwa nke bụ maka okpuru ọchịchị Akoko Edo, hapụrụ ngalaba ụlọakụ etiti bụ CBN dị na Bini, gawa Akoko Edo n'ụgbọala pụrụ iche etinyere ihe a ga-eji amata ebe ọbụla ya bụ ụgbọala nọ. Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Karina Igonikon si were kọwaa, Akoko Edo so n'okpuru ọchịchị mbụ a ga-ebuga akụrụngwa ntuliaka n'ihi na ọ dị anya site na Bini, Isiobodo Edo steeti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-45227252,https://www.bbc.com/igbo/media-45227252,FIFA: Infantino agbaala Dalung na ọgbakọ ya nkịtị,Ngalaba na-ahazị egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile a kpọrọ Federation of International Football (FIFA) gbara onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Solomon Dalung nkịtị oge ọ,"kpọrọ ọgbakọ n'etiti ya na FIFA. Dịka akụkọ si gaa, FIFA gbara nkịtị makana ha ka na-ewe iwe na gọọmentị wepụrụ Amaju Pinnick dịka onyeisi ngalaba na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa nke a kpọrọ Nigeria Football Federation (NFF) na Bekee. Cheta na FIFA nyere Naịjirịa ruo ubọchị 20 n'ime ọnwa Ọgọst ịgbanwe mkpebi ha maka ịchụda Amaju Pinnick dịka onyeisi. Dalung degaara onyeisi FIFA bụ Gianni Infantino akwụkwọ ozi na ya na mmadụ ruru 15 si ala Naịjirịa chọrọ ịhụ ya. Mana FIFA deghachịrị Dalung akwụkwọ ozi na ya enweghị ike ịhụ ya. Ha jụkwara ihe mere Chris Giwa so n'ime ndị chọrọ ịhụ Infantino makana o nwere mkpebi kwuru na o kwesịghị iso n'ọgbakọ ọbụla gbasara egwuregwu bọọlụ. Ha dọkwara Naịjirịa aka na ntị nke ọma na ọ bụrụ na Naịjirịa akpọghachiteghị Pinnick dịka onyeisi NFF Naịjiria, na ha ga-amachi Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45649659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45649659,Akụkọ dị mkpa taa: Ndị agha nnupuisi si Sịrịa na Ịraq bụ nsogbu anyị - Buhari,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a,"Ihe Buhari kwuru na United Nation Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola ọzọ na ọ bụ ndị agha nnupuisi gbara ọsọ na Syria, Iraq na Libya butere oke iyi ndụ egwu na mpaghara Lake Chad. Buhari kwuru nke a ụnyaahụ n'ọgbakọ ndị United Nation na-eme na New York. Nfanyeaka n'ụkwụ NLC Otu jikọtara ndị ọrụ bụ ""Nigerian Labour Congress"" enyela ndị otu niile iwu ka ha malite abụbọọrụ n'ime abalị taa. Otu a kwuru na nke a bụ iji dọ gọọmentị aka na ntị ka ha leba anya n'okwu banyere ụgwọ opekatampa nke ndị ọrụ. Akụkọ si mba ọzọ Ihe ruru mmadụ iri na abụọ bụ ndị agbụrụ Taureg na Mali anwụrụ ụnyaahụ dịka ndị ji egbe wakpochara ha Nke a bụ n'ihi ọgbaghara dị n'etiti ndị agbụrụ ahụ na ndị agha nnupuisi Jihad bụ nke tarala isi mmadụ narị abụọ kamgbe afọ a. N'egwuregwu Otu egwu Derby County ji ọkpụ asatọ asatara asaa na penariti merie Manchester United n'asọmpi iko Carabao Nke a pụtara na Manchester United akwakọrọla pụọ n'asọmpi ahụ. Gee akụkọ ndi ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke ụtụtụ a Okporoụzọ ala Igbo" media-46245907,https://www.bbc.com/igbo/media-46245907,"Nigeria vs South Africa: Super Eagles ga-eso agba ""Iko mba Afrịka""","Akụkọ dị mkpa N'egwuregwu,","Naịjirịa agafeela ma sonye na ndị ga-agba Iko mba Afrịka nke 2019 ka ha na Saụt Afrịka ji otu goolu gbaa onye laba onye laba. Ebe Libya ha na Naịjirịa nọ n'ime otu Otu E ahụ, ji ọkpụ goolu asatọ a satara naanị otu nyụọ ndị Seychelles anya. Onye ọkachamara n'egwu bọọlụ aha ya bụ Ejike Kanife, kọwara ihe ""onye laba onye laba"" a pụtara. End of Twitter post, 1 O kwuru na 1-1 Naịjirịa na Saụt Afrịka gbara mere ka Naịjirịa nọrọ n'elu tebulu otu E, ma mekwaa ka ha gafee n'ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka 2019. O kwukwara na Naịjirịa gbara ọfụma n'egwuregwu a, ma kwuo na goolu abụọ Naịjirịa nyere nke onye ogbu pịpịrọ gufuru, kwesịrị ịbụ goolu. Libya ka nwere ohere igafe maọbụrụ na na ha jiri ọtụtụ goolu merie Saụt Afrịka mgbe ha ga-ezute ọzọ. Makana mmeri ahụ ga-eme ka Libya nwere pọintị asaa ugbua ga-eji otu pọịntị gafee Saụt Afrịka nwere pọịntị itoolu. Cheta na Naịjirịa esoghị gbaa nke afọ 2015 makana ha akpataghị ike ha ga-eji eso ndị gafere. Ntuliaka 2019 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ekwuola na ha ga-ebuli iwu machiri ịgagharị n'obodo maka nkwado ịzọ ọchịchị nke 2019. Nke bụ na bido n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa a, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike ibido ihe Bekee kpọrọ ""Campaign"". Ihe Saraki kwuru maka Zik Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki, butere ụkpa otuto nye Odogwu ndị Igbo bụ Nnamdi Azikiwe n'emume e mere iji cheta ya n'Ọka. Saraki kwuru na Zik mere ọtụtụ ihe ọma e ji echeta ya, na ọ bụ onye anaghị akpa oke ma bụrụ ọkụ nye ndị agbụrụ isi ojii. Na mba ofesi, Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ ka ndị mmadụ pụtara ime ngagharịiwe na mba Frans. Ndị mere ngagharịiwe Iwe ndị a bụ na ego mmanụ ụgbọala ejirila pasentị iri abụọ na atọ rịgo elu karịa ihe ọ nọbu, n'ime otu afọ. Gọọmenti enyela ego enyemaka n'ịku osikapa Gọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ego ruru ijeri naira 60 dịka ego eyemaka n'ịkụ osikapa na Naịjirịa. Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Audu Ogbe kwuru na mkpebi a bụ maka ị hụ na egọ eji azụ osikapa gbadata n'ahịa. ""APC bụ ụlọ mpu"" Otu ụka Christ na Naịjirịa bụ Christian Association of Nigeria agwaala onyeisiala Muhammadu Buhari na patị ya bụ APC aburula ụlọ ebe ndị mpu na aghụghọ na-ezo . CAN gwara Buhari na oge eruola ị buso ndị niile na-etinye aka na mpu na aghụghọ agha n'ezie agbanyeghị onye ha bụ n'ala Naịjirịa. Abaribe Sinatọ Enyinnaya Abaribe agwala gọmentị etiti ka ha gba mbọ hụ na a nwere ọgbakọ ga- akwalite udo na Naịjirịa. Abaribe gwara ndị nta akụkọ na ọ bụ sọọsọ gọmentị nwere ike ị hụ na udo laghachịtere az ụ n'etiti otu okwukwe n'obodo dị iche iche na Naịjirịa. Ụbọchị ezumike Gọọmentị etiti ekwuola na ụbọchị tusde bụ ụbọchị iri abụọ n'ime ọnwa ga-abụ ụbọchị ezumike. Mkpebi a bụ ka ndị ụka alokoba nwere usoro ha ga-ji me mme mme ha bụ Eid-el Maulud. Ọkụ Kalifonia N'ofesi, ndị gbatagbata na-ekwu na ha ka na-achọ mmadụ ruru otu puku n'obodo Kalifonia ebe nnukwu ọkụ gbara ọtụtụ ụlọ nakwa gbuo mmadụ ruru iri asa na otu. N'egwuregwu, Otu Super Eagles na mba Saut Afrịka ga-asụkọta mpi taa n'asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-eso n'asọmpi iko mpaghara Afrịka n'afọ 2019. Super Eagles na ndị Bafana Bafana ga-ezute taa n'elekere abụọ nke ehihie. Gee nkeji ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Di na nwunye mụrụ ejima atọ" afirika-45515858,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45515858,Imo State: Uweojii anwụchiela ndị gburu Ụkọchukwu Katọlik,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:,"Aka akpara ndị gburu Ụkọchukwu Ndị uweojii nke Imo Steeti anwụchiela mmadụ abụọ ndị so gbabguo onye ụkọchukwu katọlik bụ Jude Egbom na mọnde bụ abali iri nke ọnwa seputemba. Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji bụ Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ ndị a na onye ụkọchụkwu ahụ si n'otu obodo bụ Nkwere dị n'Imo Steeti. Enwerem kwuru na ndị a na-enyere ndị uweojii aka, iji chọpụta ndị otu ndị gbara ọsọ, na nyocha na-aga n'ihu ị ma ihe ha kwere gbuo onye ụkọchukwu ahụ. Naịjirịa alaghachịla n'iji oke ụgwọ - Amina Mohammed Osote odeakwụkwọ ukwu otu United Nation bụ Amina Mohammed ebeela akwa n'ụdị ụgbwọ Naịjirịa ji ugbua dị egwu. O kwuru nke a n'ọgbakọ ndị otu IMF na UN nwere maka mmerikọta nlụbọchi Tuusday. N'okwu ya ọ si na onye bụbu minista na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala gbara mbọ ị na-apụta Naịjirịa n'ụgwọ mana ugbua ha banyekwala n'iji ụgwọ ọzọ. Yakubu Dogara awụfela pati PDP Akụkọ kachasị: Aka akparala ndị gburu Ụkọchukwu Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Yakubu Dogara agbala akwụkwọ ịzọ ọkwa ọzọ mana ọgbataghị ya n'aka pati APC. Kepukepu na-ekwu na ọ bụ n'aka pati PDP ka ọ gbatara ya bụ akwụkwọ. Na nzaghachi, pati APC kwuru na o jughi ha anya na Dogara agafela PDP, ha kwuru na ọdịla anya ọkpawara agwa megidere pati APC. Egbuola ọtụtụ ndị gara ịgba nkiri na Zamfara Steeti Ndị oji egbe kpọpere mgbọ egbe ha n'etiti igwe mmadụ bụ ndị gara ile ihe nkiri n'ụlọ nkiri bụ Cinema dị n'otu obodo na Zamfara Steeti. Mwakpo a bụ nke mere n'abalị ụnyaahụ tara isi mmadụ iri na otu ma merụọ ihe karịrị mmadụ iri abụọ ahụ. Akụkọ si mba ofesi Mba ụwa niile gbakọtara ọnụ taa na mba Ghana ịkwanyere Kofi Annan bụbu onye odeakwụkwọ United Nation ugwu nke ikpeazụ n'emume olili ya. Cheta na Koffi Annan nwụrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2018 dịka ọ gbara afọ iri asatọ. N'egwuregwu Onyeisioche Manchester City bụ Khaldoon Al Mubarak ekwuola na njem ndị otu ahụ amalitebeghi agbanyeghi ego nweta ha karịrị nde narị Yuro ise. Man City so n'ime otu egwuregwu abụọ na mba Ịngland na-enweta ụdị ọnụ ego ahụ. Nkeji nke abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Kofi Annan" afirika-56574283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56574283,Adani Community Clash: Etu e si gbuo mmadụ isii na mwakpo mere n'obodo a dị n'Enugwu Steetị,Kọmishọna uweojii n'Enugwu Steetị bụ Mohammed Aliyu na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ wuchiri n'obodo Adani ịchọpụta ihe butere ọgbaghara nke tara isi mmadụ isii n'ebe ahụ n'ụbọchị ụka.,"Ọ sị na ọ bụ ndị ekperima a na-amaghị ndị ha bụ kpara arụ ọjọọ a nke tara isi mmadụ isii, merụọ mmadụ abụọ ahụ ma kpọọ ọtụtụ ngwongwo ọkụ. Aliyu rịọrọ ka udo chịa ma nye iwu ka e mee nyocha tara ọchịchị iji nwuchie ndị aka ha dị n'arụ a. O kwere ndị obodo a nkwa na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-ejikọ aka ọnụ ịhụ na ụdị nsogbu a emeghi ọzọ. Ọ rịọrọ ka ha gbanarị nsogbu ọbụla ma hụụ onwe ha n'anya dịka ụmụnne. Onyeisioche okpuruọchịchị Uzo-Uwani bụ Chukwudi Celestine Nnadozie kerele ndị uweojii maka mbọ ha gbaran'iweta udo n'ogbe ahụ. Onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Brown, Ekwoaba, nke Civil Defence bụ Valentine Afrika na nke ndị ọgwụike bụ Abdul Abdullahi so mee njem ahụ. BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete eze ọdịnala ndị Adani nakwa ndị hụrụ ka ihe ji mee. Akụkọ ka na-abịa..." 46057220,https://www.bbc.com/igbo/46057220,Nnamdi Kanu: Abaribe na Fani-Kayode ga-agwa anyị ka o si gbapụ na Naịjirịa - Ọkaiwu,E depụtala akwụkwọ ikpe n'ụlọikpe dị n'Abuja ga-ahụ na enyochara ma nwụchie ndị dịka onye bụbụ Minista na-ahụ maka ụgboelu bụ Femi Fani-Kayode nakwa Sinetọ Enyinnaya Abaribe na ndị ọzọ.,"Onye depụtara ya bụ akwụkwọ ikpe bụ Isaiah Ayugu, nke kọwara onwe ya dịka ọkaiwu na-akwụ ụtụ isi ya na Naịjirịa. Ayugu kwuru na ọ bụ maka na Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa kpatara ikpe ebubo ịmegide ala Naịjiria ji ka kwụrụ na-emetụghị aka n'ihu ọkaikpe ndị ụlọikpe gọọmenti etiti bụ Binta Nyako. O kwuru na asị niile na ebubo a na-ebo ndị agha Naịjịrịa na ha gburu ma tọrọkwa Namdi Kanu na-eme ya ezigbo ihere. O boro Fani-Kayode ebubo na o kwuru na ọ tụrụ asị gbasara ikpe ahụ nke butere ngbapụ Nnamdi Kanu na Naijirịa. Ọ bụghị nani Fani-Kayode ka o na-atụ aka ka a nwụchie, ndị ọzọ gụnyere Abaribe, Tochukwu Uchendu nakwa Emmanuel Shallom Ben bụ ndị gbaara Nnamdi Kanu aka ebe mgbe ụlọikpe tọghapụrụ ya n'ọnwa Epreelụ nke afọ 2017. Ndị ọzọ gụnyere ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor nakwa ndị be onyeisi IPOB bụ Emmanuel na Uchechi Kanu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44544321,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44544321,Ọ ga-ara ahụ onye ntorobịa imeri ọkwa onyeisiala Naịjirịa - Yul Edochie,"Ọ bụ eziokwu na onye na-ekpokoba otu pati PDP bụ Austin Akobundu apụtala kwuo na onweghi mgbepati ahụ ji kwuo na akwụkwọ fọm iji zọọ ọkwa onyeisiala na pati apụtabeghi, mana akụkọ pụtara na ego ọnụ akwụkwọ fọm ahụ bụ nde naịra iri na abụọ.","Naijiria ga eme ntuliaka n'afọ 2019 Ya bụ ọnụ ego dịka o yipuru ndị mmadụ akwa n'ama ọkachasị ndị ntorobịa chọrọ ịzọ otu ọkwa ahụ. Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla etu pati ga-esi tinye ego fọm ha n'ụdị ọnụ ahụ, ọ pụtara na o nwere ndị ha chọrọ ịchụpụ na-ebidobeghi ebido? Ajụjụ a ka nwa ntorobịa Igbo chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 ma bụrụ onye na-eme ihe onyonyo aha bụ Yul Edochie zara BBC Igbo. Edochie kwuru na ọ ga-abụ ihe tara akpụ ka onye ntorobịa merie ntuliaka onyeisiala na Naịjirịa maka etu ihe si kwrụrụ. O kwuru na ndị pati anaghị eme ihe n'usoro ga-adabara ndị ntorobịa. N'okwu ya; ""Ego ịgba akwụkwọ fọma ka bụ obere okwu, mgbe ịgbatasịrị akwụkwọ ahụ we gazie ịhụ ndị isi sekpụ ntị n'otu pati ahụ, ị hụ na ego karịrị akarị. ""Onweghi onye ntorobịa aka ya ga-eru n'ụdị ego ahụ."" Yul Edochie Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ n'Anambara steeti n'afọ 2017 zọrọ ya n'okpuru pati APGA. Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'iwu #NotTooYoungToRun n'oge na-adịghị anya inye ndị ntorobịa ohere ịbanye ọchịchị. Iwu ahụ belatara afọ e tinyere e ji azọ ọkwa dị icheiche na Naịjịrịa mana ọ bụrụ na ndị patị tinye ụdị ego ahụ iji gbaa fọm na patị ha, ị mara na otu abụghụ n'ezi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43750807,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750807,Kedụ ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee na Naịjirịa?,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:,"Ihe onyonyo taa Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto. 'Ọrụ gị kwesiri ịbụ nke kachasị mma na foto' Ncheta ikpeazụ Achuzia Achuzia nwetara echichi Ikemba nke Ahaba nakwa Ọchịagha ndị Anịọma oge ọ dị ndụ Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha. O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ. A ga-eli Achuzia echi n'Asaba. Ego Abacha zuru Abacha bụ onye agha, chịrị Naịjirịa afọ ise dịka onyeisiala tupu ọ nwụọ n'afọ 1998 Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwenyela na onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Sanị Abacha, zuru ọtụtụ ego. O were Buhari afọ iri ikwenye ma kwupute site n'ọnụ ndị mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba, na nde dọla narị atọ na iri abụọ na abụọ ($322.5) ndị mba switzerland nyeghachịrị Naịjirịa so n'ego Abacha zuru. Cheta n'afọ 2003, gọọmentị kwukwara na a hụrụ ego Abacha zuru, nke ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m). Akụkọ ndị ga-amasị gị N'akụkọ mba ofesi Mba Rọshịa bụ enyi mba Sirịa ma na-ejikwa ndị agha ha na-akwado gọọmentị ha Ndị mba Rọshịa adọọla mba Amerịka aka na ntị maka ibido agha n'etiti mba ha abụọ. Ha kwuru na ọ bụrụ na Amerịka si n'elu tụọ ha ogbuniigwe, ma wakpoo ha maka ebubo eboro ha maka iji ngwaagha kemịkal gbuo ọtụtụ mmadụ na Siria, na agha nwere ike ibido n'etiti ha. N'egwuregwu Arsenal bụ otu nke ise si mpaghara England ga-eru ọkara-ịkpeazụ nke Europa League kamgbe eji bido asọmpi a ruo ugbua Naịjirịa nwetara otu Ihe nrite n'egwuregwu commonwealth ụnyaahụ, nke mere ka nchịkọta ihe nrite ha bụrụ iri na abụọ ugbua. Ebe otu Arsenal ji mkpokọta ọkpụ isii asatara atọ gbapụ ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa League. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45861110,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45861110,Akụkọ kachasị taa: Lee nwoke ezinaụlọ tinyere ego n'isi ya iji zọpụta ya,Akụkọ dị mkpa taa Na mba ofesi,"Ezinaụlọ Mohammed Dewji bụ ọgaranya kachasị bụ nwata n'Afrịka etinyela ego n'isi ya iji zọpụta ya. Ezinaụlọ Dewji bụ ndị Tanzania kwere nkwa ego ruru dọlla puku narị anọ na iri anọ a ga-enye onyebụla nyere aka iji chọta ebe ọ nọ. N'ala Igbo IPOB: Ụmụ ntorobia a agaghị atụ vootu na 2019- Ugochukwu Uko Elliot Ugochukwu-Uko bụ onye ndụ otu ntorobịa ndi Igbo akpọrọ IYM n'aha ịchafụ ekwuola na otu IPOB agaghị atụ votu na ntuliaka 2019. O kwuru na ọ bụ n'ihi mkpagbu ndị ọchịchị dị ịcheiche n'ala Igbo na-akapgbu ha. Ọzọ, Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia Steeti ekwuola na onweghi okwu banyere akụkọ na-ekwu na aha ya so na ndị a machiri ime njem na mba ofesi. N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, O kwuru na onweghi ihe nke ahụ pụtara ya mere na ọ gaghị aza ajụjụ banyere ya. N'egwuregwu, Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba Briten akatọọla omume ndị nkwado England na-eme n'obodo Seville dịka Spain na England na-akwado ịzute onwe ha n'asọmpị UEFA Nations League na mgbede a. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụtụtụ Gọọmenti etiti agọrọla ụkwụ na aka ha Onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onweghi aha ndị ha wepụtara dịka ndị gọọmenti machiri ime njem mba ofesi. Ọsịsa a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ gọọmenti etitti maka ikwu na onwere aha ndị amachiri ime njem. Mana n'abali ụbọchịụka, ojeozi mgbasaozi Buhari bụ Garba Shehu gọrọ sị na iwu Executive Order 6 nke machiri ụfọdụ ị ga njem si n'aka ọchịchị chịburu tupu ha banye. Ọkụ mmanụ gaasị n'Abia steeti Ndị eze nọ na mpaghara Abịa steeti ebe ọkụ mmanụ gaasị gbara ekwuola na ọdachi ahụ eriela isi mmaddụ karịrị otu narị na iri ise. Onyeisioche ndị Eze nọ n'ọkpuru ọchịchị Osisioma bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu kwuru na ọnụọgụgụ gbalitere dịka ọtụtụ ndị nọ n'ụlọọgwụ mechara nwụọ. N'ofesi Otu United Nation na-adọ aka na ntị na oge na-adịghị anya na agụrụ ga-anyụ ndị mba Yemen ịkpakwụ ma ọ bụrụ ma ọgụ gaa n'ihu na mba ahụ Onye nchịkọta ọrụ United Nation nọ na Yemen bụ Lise Grande kwuru na ọnọdụ Yemen bụ ihe ihere nye mba ụwa niile. N'egwuregwu Onye nkọwapụta egwuregwu bọọlụ akpọrọ commentator na bekee bụ Peter Brackley anwụọla dịka ọgbara afọ iri isii na asaa mgbe ọ rịachara obere ọrịa. Brackley bidoro ọrụ ya n'ụlọọrụ BBC Radio dị na Brighton tupu ọ gafe na ngalaba TV. Gee nkeji ugbua Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo" afirika-44098734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44098734,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mmadụ 26 anwụọla maka referandum,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:,"Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị Ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo maka izu akwụkwọ ntuliaka ime ụlọ nke APC n'Imo steeti. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood, kwuru na a nwụchiri ha n'otu ụlọ oriri dị n'Abuja, site n'ama mmadụ gbaara ha. Nwata akwụkwọ Dapchi Boko Haram ji N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 100 Onyeisi otu jikọrọ ụka ọgbara ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ PFN n'aha ịchafụ bụ Felix Omobude, agwala gọọmenti etiti ka ha kwụọ ụgwọ ma gbapụta Leah Sharibu, bụ nwata akwụkwọ Dapchi ndị Boko Haram kpachiri. Cheta na ndị Boko Haram ka ji Leah Sharibu bụ otu n'ime ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110 ndị Dapchị dị na Yobe steeti ha tọọrọ n'ọnwa Februari 19, n'ihi na o kwenyeghị ịjụ Kraịst. N'akụkọ mba ofesi Ndị nchekwa e keela nkwụcha dịka ndị otu anọghị n'ọchịchị kwere nkwa imebi ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị Mee 17 Ihe ruru mmadụ iri abụọ na isii nwụrụ ka ndị omekome wakporo obodo Cibitoke dị na mba Burundi, ụnyaahụ. A na-ekwu na ndị a bu egbe na mma ma gbakwaa ụlọ ndị mmadụ ọkụ, kpara mkpamkpa a iji mebisia referandum nke nwere ike ime ka onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza bidoro ịchị kemgbe afọ 2005 chịa ruo afọ 2034. N'Egwuregwu Onye ga-edubanye otu ha n'ime Champions League n'afọ na-abịa n'etiti Antonio Conte na Jurgen Klopp? Taa ka asọmpi premier league nke afọ 2017/2018 ga-agwụ. Ihe ọ pụtara bụ na otu Chelsea na Liverpool ga-azọ ọnọdụ ọkwa anọ, nke ga-enye ha ohere ịsọ mpi Champions League nke afọ na-abịa. N'akụkọ ọzọ, Alex Kibet, onye Kenya, bụ onye meriri n'ọsọ Okpekpe a gbara n'Edo steeti na Satode. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa" afirika-51187297,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51187297,"2022 World Cup : E tinyeela Nigeria na 'Group C""",E tinyeela otu egwu Super Eagles na Group C n asọmpị iji tozuo ị ga Iko Mbaụwa nke ga-amalịte n'ọnwa Oktoba afọ 2020.,"Mba ha na Nigeria nọ na otu ahụ bụ Cape Verde, Central African Republic nakwa Liberia. Ndị Algeria, Burkina Faso, Niger, Djbouti nọ na 'Group A.' Tunisia , Zambia, Mauritania, Equitorial Guinea, nọ na Group B. End of Twitter post, 1 Ndị omeiwu itoolu n'Imo steeti amabaala APC Ime ụlọomeiwu Imo steeti Mmadụ itoolu ndị omeiwu Imo steeti a hapụla pati ha mabanye na APC. Nke a na-eme n'ọgbakọ mbụ ụlọ omeiwu steeti ahụ na-enwe kamgbe Hope Uzodinma nke APC banyechara n'oche gọvanọ. Ndị omeiwu ahụ gụnyere: Okey Onyekanma N'ime ọgbakọ a ka osote onyeisi ndị omeiwu ahụ aha ya bụ Okey Onyekanma nọkwara kwuo na ya agbaala arụkwaghị m. Onyekanma ritukwara dịka onyeisioche kọmiti na-ahụ maka etu ndị ọgbakọ ndị omeiwu si aga. Onyekanma kwuru na ihe ya ji aritu n'ọkwa bụ ka onye si mpaghara Ọlụ were ya bụ oche dịka nkwekọrịta ha nwere sị dị. Akụkọ ọzọ malitere ifegharị na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Collins Chiji esila PDP baa APC. Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na nke ahụ abụghị ezie. Anyị amachibeghị ọkada na keke - Gọọmentị Legọs Gọọmentị Legọs akọwaala na ha amachibeghị ọkada na keke ịgba n'okporoụzọ awaraawara nakwa akwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ. Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ malitere ifegharị na-ekwu na a machiela ha. Kọmishọna mgbasa ozi na Legọs bụ Gbenga Omotoso kọwara na ha ka-naeleba anya n'okw gbasara ọkada na keke mana ha enwebeghị mkpebi ọbụla gbasara ya. Omotoso kwuru na akụkọ gbasara mmachị keke ""abụghị eziokwu"". Ortom na Fintiri emeriela Ụlọikpe kachasị ekpebiela ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti Benue nakwa Adamawa. Ha kwuru na Samuel Ortom na Umar Fintiri bụ ndị meriri ya bụ ntụliaka n'otu n'otu. Malabu Gọọmentị etiti akpụpụla Mohammed Adoke ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na iri aka azụ n'okwu gbasara ụmị mmanụ agbidi a kpọrọ 'Malabu oil well'. Adoke bụ onye ji ọkwa Ọkaiwu gọọmentị etiti n'oge Goodluck Jonathan ji ọkwa onyeisi ala. O teela aka gọọmentị etiti boro Adoke ebubo a, mana ọ gbara ọsọ gbaga obodo Dubai. Ndị uwe ojii mbaụwa bụ 'Interpol' mechara nwụchie ya n'ọnwa Novemba afọ 2020 ma kpụlata ya Naịjirịa na Disemba. Mana Adoke ekwuola ugboro ugboro na ya adaghị iwu ọbụla kama na ya mere ihe onyeisiala oge ahụ bụ Jonathan gwara ya ka ya mee. Ọ bụghị naanị Adoke ka gọọmentị etiti gbara akwụkwọ a. Ndị ọzọ gụnyere Aliyu Abubakar, Rasky Gbinigie, ụlọọrụ mmanụ agbidi bụ Shell, ụlọorụ Agip, nakwa ụlọọrụ Malabu. Liman Andimi Ụkọchukwu Lawan Andimi Ndị otu Boko Haram egbuola onye isi otu 'Christian Association of Nigeria' (CAN) nke okpuru ọchịchị Michika dị n'Adamawa steeti. Aha ya bụ Lawan Andimi. Ọ bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Ahmad Salkida kọwapụtara nkea. Salkida kwuru na ndi Boko Haram bepuru Andimi isi, ya na otu onye agha Naịjirịa ọzọ. O kwuru sị: ""Andimi bụ onye isi ụka, nna, nakwa onyendu obodo ya."" Salkida kwukwara na ọ bụ n'ehihie ụbọchị Monde ka e gburu Andimi. Ndi Boko Haram nwụchiri Andimi oge ha wakporo obodo Michika na mbido ọnwa a. Ha gosiri ya n'ihe onyonyoo ebe ọ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ya ọsọ enyemaka. Mana enyemaka ahụ abịaghị. Gọọmentị Naịjirịa ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a. 'Lassa Fever' Oke na-ebutekarị ọrịa 'Lassa fever' Ọrịa a na-eche na ọ bụ Lassa egbuola ndị dọkita anọ na otu onye ọzọ n'ụlọọgwụ mahadum Aminu Kano nke dị na Kano steeti. Otu n'ime ndị isi ụlọọgwụ ahụ aha ya bụ Imam Bello gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ọbara ndị ahụ nwụrụ anwụ ka e nyochaa ya mata kpọmkwem ihe gburu ha. Mkpụrụ okwu 'Oxford Dictionary' nke 2020 Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020? Okwu ndị a gụnyere ọkada, buka, k-leg, agric, danfo, chop chop, barbing salon, dịrị gawazie. Buhari ezutela Boris Johnson Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla mba Briten ka ha nyere Naịjirịa aka nyochaa ndị niile nwere ebubo mpụ na nrụrụaka gbatara ọsọ izendụ na mba ha. Ọ rịọrọ nke a mgbe ya na Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson na-akparịtaụka ime ụlọ n'ọgbakọ UK-Africa Investment Summit 2020 a na-eme na Lọndọn ugbua. Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara dịka ọgbakọ a na-aga n'ihu. Buhari sị na ọchịchị ya na-agba mbọ n'ibu agha megide mpụ na nrụrụaka ma e nwere ụfọdụ ọgbateuhie dị n'ụzọ. N'otu aka ahụ Buhari gwara onyeisiala Gana bụ Nana Akufo-Addo na ihe o ji gbachie okeala Naịjirịa abụghị naanị maka mbubata nri, kama na ịtụ mgbere ngwaagha na ọgwụike sokwa. Akufo-Addo na nzaghachị ya sị ka Buhari gbapụ ya ọsọ na nyocha banyere nke a n'ihi oke uru Naịjirịa baara Ghana. Gịnị ga-eme n'ụlọomeiwu Imo Steeti Anya niile nọ n'ụlọomeiwu Imo Steeti ugbua dịka ha ga-amalite nzukọ ha nke mbụ n'okpuru ọchịchị gọvanọ Hope Uzodinma. Cheta na ndị a gara ezumike Ekeresimesi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2019, mgbe Emeka Ihedioha ji ọkwa gọvanọ. N'ofesi Ndị ọrụ ahụike na mba Chaịna achọpụtala na ọrịa iku ume a kpọrọ Coronavirus nwereike isi na mmadụ fee na mmadụ site mmekọrịta ahụ. Dịka ọ dị ugbua ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ anọ ebe ọtụtụ ndị gụnyere ndị ọrụ ahụike nọ n'ọnọdụ ọjọọ. Emiliano Sala Emiliano Sala Taa ka o mere otu afọ kpọmkwem ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala lara mmụọ dịka ụgbọelu ya kpọkasịrị oge o si mba Fransị na-aga otu egwuregwu ọhụrụ ya bụ Cardif City. Na mkparịta ụka ya na BBC, Nne Sala kwuru na ọnwụ nwa ya ka na-agbawa ya obi nke ukwu na-agbanyeghị na ọ gaala otu afọ ya bụ ihe mere. Chelsea chọrọ Cavani Onye nchịkọta Chelsea bụ Frank Lampard ekwuola na uche ya dị n'ịzụ Edinson Cavani bụ onye chọrọ isi na PSG pụọ. Lampard sị na Chelsea kwesịrị mwulite ka ha nwee ike tozuo oke n'asọmpi Champions league afọ na-abịa. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn" afirika-51132548,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132548,National grid collapse: Gịnị mere ọkụ jirii nyụọ pịị na Naịjirịa?,Ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na-agbarụ ihu maka etu ọkụ jiri nyụọ pịị na mba ahụ niile ugboro abụọ n'otu ụbọchị.,"Ọ bụghị na ọkụ adịghị bụ ihe amaghị ndị Naịjirịa anya, maọbụ na nke a mere ka nke na-emebu mbụ. Nke na-ese okwu bụ ọtụtụ mmadụ na-akọwa na ya bụ ihe adịgidela ruo oge ọ kwesịrị ịbụ ihe adịghị akọzị akọ. Ihe a mere ka aha dịka ""NEPA"" na ""National Grid"" malite iwu na Twitter ka ndị mmadụ na-ekwu uche ha maka ụlọọrụ ọkụ latrik dị iche iche. Ngalaba na-ahụ maka ma ikesa ọkụ a kpọrọ ""Transmission Company of Nigeria"" (TCN) wepụtara okwu ha jiri kọwa ihe mere. Ha sị na ọ bụ ọdịda igwe na-ebu ọkụ latrik gagharịa Naịjirịa dara, butere enweghi ọkụ na Naịjirịa dum. ""E nwere otu nsogbu akụrụngwa anyị nwere ka o ji nkeji iri atọ na anọ gafee elekere iri na abụọ nke ehihe. Ya bụ nsogbu metụtara ọku ịga ụfọdụ mpaghara Naịjirịa."" Ka nke a mechara, ụlọọrụ na-eke ọkụ latrik dị iche iche malitere ịkọwara ndị na-ego ha ọkụ ihe mere. Ulọọrụ Ikeja Electric dị na Legọs gwakwara ndị ahịa ha etu okwu siri kwụrụ. Lee etu ndị Naịjirịa siri tinye ọnụ n'akụkọ ọkụ na-adịghị ọzọ na mba ahụ niile. Ndị a na-eme ụlọọru ọkụ latrịk akaja site n'ịkpọ ha 'ochie' ha. TCN na onwe ha ekwuola na ha emesiela ihe kpara enweghị ọkụ a: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" afirika-49089613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49089613,Ministers List: Ihe ndị ị maghị maka ihu ọhụrụ so na ndị mịnịsta,Ahia a na-eche azụọla kama ọ bụghị mmadu niile biara ahia.,"Aha ndị mịnịsta ga-eso rụọ ọrụ n'ọchịchị Muhammadu Buhari agba nke abụọ apụtala. Dịka Buhari kwere nkwa na ya ga-eji aka ya nyoputa ndị tozuru irụ ọrụ, mana n'ime aha ndị a, e nwere naanị ihu ihu ọhụrụ iri na atọ. Lee ndepụta ndị bụ ihu ọhụrụ nakwa ihe ndị ị maghị maka ha: Sharon Ikeazor: Sharon Ikeazor bụ okaiwu si Anambra steeti ma rụọ ọrụ dịka dịka onyeisi 'Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)' Ada Anambra steeti a bụ okaiwurụburu dịka onyeisi 'Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)' Lee ihe ndị mmadu kwuru maka nhọpụta a họpụtara ya. Henry Okelue kwuru na nhọpụta di mma na ekwu kwa na ezigbo ọrụ Sharon Ikeazor rụrụ na PTDA bụ ezigbo ọmụmaatụ. Femi Fani-Kayode zigara ya ozi ekele na Twitter. Wale Adetona gosipụtara obi ụtọ ya ma kwuo na ọ ma ọrụ ya. Uchechukwu Sampson Ogah Uchechukwu Sampson Ogah bụ nwaafọ Abia steeti ma bụrụ kwa onyeisi ulọ ọrụ nmanụ agbidi bụ 'Master Energy Group' nke nwere ngalaba azumahia ruru iri na ise. Uchechukwu Sampson Ogah bụ nwaafọ Abia steeti ma bụrụ kwa onyeisi ulọ ọrụ nmanụ agbidi bụ 'Master Energy Group' nke nwere ngalaba azumahia ruru iri na ise. Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya. Chukwuemeka Nwajiuba Chukwuemeka Nwajiuba bụ okaiwu ma bụrụ kwa nwaafọ Imo steeti onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi Unitrust Insurance Co. Ltd .O crukwara ugboro abụọ n'ulọ omeiwu nta. Nwa afọ Imo steeti bụ okaiwu ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi 'Unitrust Insurance Co. Ltd . Ọ nọchikwara ndị be ha ugboro abụọ n'Ụlọomeiwu Nta. @Ekensazubuike kwuru na nhọpụta ya bụ ihe ziri ezi. Timipre Sylva Timipre Sylva chibụrụ dị ka Gọvanọ Bayelsa steeti . Timipre Sylva chibụrụ dịka gọvanọ Bayelsa steeti bido n'afo 2007 na 2008. Ogedi Festus kelere ya maka nhọpụta a họpụtara ya. Johnson Collins Ufuoma kwuru na nghoputa a ghọpụtara Timipre Sylva amasighị ya Godswill Obot Akpabio Godswill Akpabio chiburu ka Gọvanọ Akwa Ibom steeti ma bụrụ kwa onye okaiwu ma onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị Lee ihe ndi mmadu n'ekwu maka nghọpụta aghọpụtara ya - Emjay Ekanem na-ekele ya Eleshtalks ruturu aka maka ikpe o chere na ọ nwere Festus Keyamo nwaafọ Delta rụrụ ọrụ ka ọnu na-ekwuchitere otu na-ahu maka ndọrọndọrọ ọchichị Muhammadụ Buhari mgbe ọ na-azọ okwa Onyeisiala. Festus Keyamo, nwaafọ Delta rụrụ ọrụ ka ọnu na-ekwuchitere otu na-ahu maka ndọrọndọrọ ọchichị Muhammadụ Buhari mgbe ọ na-azọ okwa Onyeisiala. Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya Adebayo Bankole Akintunde gosiputara na otụghị anya nghopụta ya Emmanuel E Uduaghan na-ekele ya Gbemisola Ruqayyah Saraki Gbemisola Ruqayyah Saraki chịrị dị ka onyennọchite ndị 'Kwara Central Senetorial District' n'otu PDP n'afọ 2003, ọ banyere APC n'afọ 2015 Lee ihe ndị mmadu n'ekwu maka nghọpụta ya Oluwatobi Akangbe T kwuru na Gbemisola Saraki na-eri elele igba nwanne ya mgba okpuru Najeebwali kwuru na kpakpando ọhụrụ ebiliela Rauf Aregbesola Rauf Aregbesola Lee ndị ụgbọ Minista hapụrụ 1) Solomon Dalung 2) Abdulrahaman Dambazau 3) Udo Udoma 4) Isaac Adewole E 5) Okechukwu Enelamah 6) Emmanuel Ibe Kachikwu 7) Mansar Dan Ali 8) Audu Ogbeh 9) Adebayo Shittu 10) Usani Usani Lee Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48249138,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48249138,Sex strike: 'Ụmụnwaanyị gbaanụ abụbụ mmekọ ahụ nwoke ọbụla maka iwu ike ime' - Alyssa Milano,Onye na-eme ihe nkiri ama ama dịka Alyssa Milano arịọla ụmụnwaaanyị ka ha gba abụbụ mmekọ ahụ ha na nwoke.,"Ọ gwara ha mee nke a iji gosi iwe ha gbasara iwu ọhụrụ e wepụtara na steeti Georgia dị na mba US. Iwu ahụ na-emegide nwaanyị ikekpa ime. Nke a mere #Sexstrike ji ewu n'elu soshal midia. N'akụkọ ọzọ, Aka chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ekwuola na onweghị ụlọ, ọbaego maọbụ azụmahịa o nwere na mba ofesi. Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Ikechukwu Eze depụtara nke a n'akwụkwọ ozi n'iji saghachị akụkọ pụtara na ọkaịwu gọọmenti etiti tinyere aha ya n'ikpe dị n'ụlọikpe dị na London maka ebubo ịna aka azụ azụmahịa mmanụ na-akwụghị ọtọ. Achụpụla Boko Haram n'obodo anọ na Borno Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị omekatara pụọ ụjọ n'anya akpọrọ Boko Haram anọ dịka ha na-eme atụmaatụ ""Ọnyịrị ọnwụ"" . Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Sagir Musa kwukwara na ha hazigharịala obodo Surdewalla, Ranwa, Baladayo, Sabon Gari na Shetimeri ebe ndị omekoome a na-akpa mkpa mkpa di egwu. N'egwuregwu, Manchester city emeriela English Premier League nke izu 2018/2019 dịka ha merichara Brighton ọkpụ anọ asatara otu. City gbagoro n'ogo nke mbụ tebulu Premier League dịka ha ji otu pointi gafee Liverpool n'ọzị n'ogo abụọ. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ihe ngwa egwu Igbo jiri masị anyị - Chikaima na Chinonoru" afirika-50227971,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50227971,Dice Ailes: Onye bụ 'Sarah Baartman' a e ji maka ya adọri ya?,Sarah 'Saartjie ' Baartman bụ otu nwaanyị ụfọdụ akụkọ ụwa agaghị echefu maka ihe ọ gabigara n'aka ndị ọcha oge ọ bụ ohu.,"Eserese na-egosi Sarah Baartman site n'akụkụ ya na n'ihu ya Baartman bụ nwaanyị mba Saụt Afrịka otu dọkịta mba Briten kpọfere ala Bekee, hụrụ nwịị n'obodo oyibo makana e ji ya were na-eme akaja ma bụrụ onye ọha na-abịa agba nkiri. Dịka akụkọ mgbe ochie si kwuo, dọkịta ahụ tinyere ya ebe a na-akpọ ""museum"" ka ndị ọcha ibe ya na-ele ya anya ịkwa emu maka etu ahụ ya dị (o nwere nnukwu otele nke ọtụtụ ndị ọcha ahụtubeghi mgbe ahụ). Akụkọ a kwukwara na o nwere ọrịa otele ukwu a kpọrọ ""steatopygia"". N'agbanyeghi ihe Baartman gabigara mgbe ọ dị ndụ, na ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba n'afọ 1815 ka ọ dị naanị afọ 26, akwụsịghị mkparị akparịrị ahụ ya. Otu onye ọcha a kpọrọ Georges Cuvier chịkọrọ ma ụbụrụisi ya, ọkpụkpụ ahụ ya nakwa ihe ndị o ji bụrụ nwaanyị (sexual organs), wee ka na-edowe ya ebe igwe mmadụ ga na-abịa agba ya nkiri n'obodo Paris dị na mba Frans. Ha gbagidere ya n'anwụ ruo afọ 1974, mana ọ bụ n'afọ 2002 ka ndị mba Saụt Afrịka bịara kporo ihe fọrọ n'ozu ya ma lie ya n'ala ha. Ihe e ji adọri Dice Ailes Dice Ailes bụ otiegwu ezigbo aha ya bụ Shasha Damilola Alesh tiputara egwu ọhụrụ ọ kpọrọ ""Gịnịka"". Na foto o ji egosipụta egwu a ọ sị bụ maka ịgwa ụmụnwaanyị na ha nwere ike iji ahụ ha mere ihe ọbụla masịrị ha, o ji eserese Sarah Baartman tinye n'elu ya. Nke a mere ka ndị mmadụ dọkawa ya ka mpempe akwụkwọ, na-ekwu na ọ dị ka ọ maghị ihe Baartman gabigara ọ ga-eji were na-akparị ya na-aga n'ihu. Ailes na onwe ya ka ọ na-agbara isi onwe ya depụtara ebumnuche ya n'elu Twitter. Lee Ihe ndị mmadụ nwere ikwu na Twitter @Abisolathegreat kwuru sị na Ailes kparịrị Baartman site n'ihe o mere, ma jụọ ma ọ makwa onye nwaanyị o ji eserese ya mee ihe a bụ? @cremechic11 kwuru na ọ bụghị etu a ka e kwesịrị isi too nwaanyị ahụ. @ekesunvictor kwuru na ọ bụ maka ụdịrị ihe a ka o ji ewe iwe maka otu nwoke na-eke ụmụnwaanyị agbụ. @_bhadmus kwuru na nke a gosiri na akụzighi akụkọ mgbe gboo n'ụlọakwụkwọ etu e kwesịrị isi mee ya. @_mimiAbu kelere Ailes sị na ọ bụ maka ya ka o ji mara onye Baartman bụ ugbua. @OlumideOG kwuru sị na ọ ghọtaghị ihe mere e ji akpọ Ailes aha ọjọọ maka ito ahụ Baartman. Ihe nkiri ga-amasị gị: Killiwee Nwachukwu" 42725987,https://www.bbc.com/igbo/42725987,Nwoke mara nwa ya aka ntị,Otu nwoke aha ya bụ Edet Asuquo agbaala ọsọ maka ihe o mere nwa ya nwaanyị.,"Nwa nwoke ọ dị mkpa karịa nwa nwaanyị? Gịnị ka Gift mere? Nna ya na-ekwu na maka ọ bụghị nwa nwoke, ọ nweghi uru ọ bara. O jikwa maka ya kwuo na ọ ga-egbu ya. Edet na nne Gift bụ Rosemary Kingsley bụ ndị Kalabar dị na Cross River Steetị bi na Legọs. Ha anubeghi mgbe ha nwere mmekọrịta butere afọ ime. Rosemary kwabara n'ụlọ Edet mgbe ọ muru Gift. Mana obi adịghị Edet mma maka nwata a abụghị nwa nwoke etu o sịrị chọọ. Ihe kpatara esemokwu mgbe ọbụla. Na Januwarị 10, 2018 Grace bere akwa agụụ, nna ya ama ya ezigbo aka ntị maka ya, nke a mere ka ọdụdọ dọ nwata a. E bụrụ ya gbaraga ụlọ-ọgwụ. Ndị ọrụ ụlọ-ọgwụ gwara ndị ọrụ na-eche ndị nkịtị na Lagos Steeti, ha gwa ndị uwe ojii nọ nso ebe ahụ. Mgbe ndị uwe ojii ruru ụlọ Edet, ọ gbapụla ọsọ kemgbe. Onye ọrụ na-eche ndị nkịtị kwuru na ọbara si n'ịmị nwata ahụ apụta. Akara na-egosikwa na nti ya ebe. Ndị uwe ojii ka na-eleba okwu ahụ anya ya." afirika-45000246,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45000246,Ntuliaka onyeisiala na-eme na Mali ugbua,Ihe karịrị mmadụ nde asatọ na mba Mali ga-achọpụta onye ga-anọchi ọkwa onyeisiala mba ha dịka ha na-eme ntuliaka taa.,"Ibrahim Boubacar Keïta n'agwa ndị ntaakụkọ ọkwụ tupu o binye aka na ntuliaka taa. Ibrahim Boubacar Keita bụ onyeisiala ha ekwuola na o nweghi nrụrụaka ga-adị na ntuliaka ahụ nke na-eme ugbua. Onye ga-emeri ntuliaka a kwesiri ị nweta ihe karịrị vootu ọkara na mgbakọ ọnụgụgụ vootu niile atụnyere taa. Gọọmentị mba Mali na-ekwu na ha ezigala ndị nchekwa puku ịrị atọ n'ebe dị icheiche na mpaghara ala ahụ. Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka obi rue ndị mmadụ ala ebe ndị oyiegwu otu JNINM kwuru na ha ga-ebute ọgbaaghara na ntuliaka ahụ. Ọ bụrụ na Boubacar Keita dị afọ 73 merie, ọ ga-achị mba Mali afọ ise ọzọ. Ụfọdụ ebe na mba Mali anọghịzị n'aka gọọmentị dịka ndị nche UN na-echekwa ya n'aka ndị nnupu isi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-44657923,https://www.bbc.com/igbo/media-44657923,"Ohaneze: Were ego Abacha rụọ ụlọọgwụ, okporoụzọ","Onyeisi Ohaneze n'Imo steeti bụ dọkịta Ezechi Chukwu, akatọọla atụmatụ ikesa ego Abacha zufuru na steeti 19 dị na Naijria.","Dọkịta Ezechi Chukwu bụ onyeisi Ohaneze n'Imo steeti ma bụrụkwa otu n'ime ndị isiọrụ Ohaneze nke etiti Gọọmenti etiti kwuru na ha ga-eke ndị nọ n'ụbịam nde dọla 322 ($322 million) bụ ego Abacha zupuru e si Swizaland weghachị, na steeti dị 19 bido n'ọnwa Jụlai site n'inye ezinaụlọ ọbụla puku naịra ise kwa ọnwa. Mana na mkparịtaụka BBC na Chukwu nwere n'ekwenti, o kwuru na enweghị uru nke a bara. ""Gọọmentị kwesịrị ịwepụta atụmatụ ụzọ a ga-eji ya bụ ego were rụọ ọrụ maka ọdịmma ndị Naijiria site n'ịrụ ihe na-enyere ndụ aka dịka ụlọọgwụ, imezi okporoụzọ maọbụ inye mmiri n'ime obodo. I were ego na-eke ndị mmadụ n'ụdị dị iche iche agaghị enye anyị ihe achọrọ."" Dịka gọọmentị siri kọwaa, ezinaụlọ 302,000 ga-erite erere site n'ịnata puku naira ise kwa ọnwa. Steeti ga-erite n'atụmatụ nkesa ego ahụ bụ Naịja, Kogi, Ekiti, Ọshụn, Ọyọ, Kwara, Krọs Riva, Bawuchi na Gombe steeti. Ndị ọzọ bụ Jigawa, Benue, Taraba, Adamawa, Kano, Katsina, Kaduna, Platu, Nasarawa, Anambara nakwa ndị gbara ọsọ ndụ na Borno steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46025133,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46025133,Sister gbapụrụ n'ụka na-akwazi iko aghara aghara,Otu nwaagbogho Sista n'okwukwe katọlik ebuola awoo n'ogige kọnvent ha.,"Onye nun bụ nwaanyị ji onwe ya chụọ aja n'ụka ma ṅụọ iyi ị dịasọ, ị bị ndụ ụbịam nakwa ị rubeisi na-okwukwe ụka Yudy Pineda Vasquez bụ onye gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) bara ogige konvent mgbe ọgbara afọ iri n'obodo ya bụ Colombia. Yudy sị na mgbe ọkụkọ gbasara egwusi bụ mgbe otu nwokorobịa bịara n'ogige ha maka ịkwadọ ụmụaka ga-anata oriri nso. Ọ sị na ya bụ nwokorobịa riri ya obi nke bụ na ọ malitere ihu ya n'anya. Yudel kọsaara ibe ya ka ya bụ nwokorobịa sị rịe ya obi. Onye ọkọsaara ihe a gwara ya na ọ kaara ya mma na ọ ji nwanyọ pụọ mgbe ya bụ mmiri ka dị n'ogwe ọkpa. Yudel sị na ""ya bụ ihe wutere m na mbụ, mana nke ahụ agaala"". Ugbua; ""udo na ọṅụ juputara m obi"". Onye nun bụ nwaanyị ji onwe ya chụọ aja n'ụka ma ṅụọ iyi ị dịasọ, ị bị ndụ ụbịam nakwa ị rubeisi na-okwukwe ụka ""A na m agbambọ ịme ihe dị ka ezigbo mmadụ. Anaghị m agha ụka, ekpere maọbụ mụọ anya abalị"". Ugbua ọrụ Yudel bụ ime ihe onyonyo ịkwaiko nke bụ ihe oji erizi ihe ugba. Mana agwa ndị a anaghị egbochị ya ịmejuputa iwu ụka. Ị mata ka ụdị ihe a ọnwere ike ịme n'Igbo, otu onye sista ụka katọlik na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya sị na ya bụ ụgụrụ abụghị mbụ oyi. Ọ sị na ""ndị sista ụfọdụ na-adapụ na-okwukwe kwamgbe kwamgbe ma ihe ha meweziri mgbe ha pụrụ bụ akụkọ ọzọ"". Sista kwụrụ na ọtụtụ ihe na-ebute ndị sista ịdapụ n'okwukwe. Ụfọdụ ha na-eji aka ha sị na ha achọghịzị, ụfọdụ bụkwa maka ihe ha metere ka eji asị ha pụọ. Ọ sịkwa na; ""ọbụrụ na ihe onye ahụ mere abụghị ihe mmechụ ihụ, na onweghị ihe ga-egbochi onye ahụ ịnata oriri nsọ"". ""Ịgbapụ na kọnvent abụghị njọ ogbugbu. Ọ gaghị egbochi onye gbapụrụ na kọnvent ị ga ụka maọbụ ị nata oriri nso."" Onye Sista kwuru. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49382525,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49382525,Ike Ekweremadu: Ndị gbagharịrị akwụkwọ ewepụtala ikpe n'ụlọikpe,Ụlọikpe mba Jamini agbaala ama na ndị gbagharịrị akwụkwọ na mkpebi ha nyere n'okwu ịwakpo Ike Ekweremmadu ewepụla ya bụ akwụkwọ ha gbara n'ụlọikpe.,"Cheta na ụlọikpe dị na Jamini taburu mmadụ anọ a nwuchiri site na ịda ha nha ma manye ha ịrụ ọrụ akwụ ụgwọ abalị 20 maka ịwakpo Ekweremadu oge ọ gara mmemme iri ji na n'obodo Nuremberg dị na mba ahụ. N'ọsịsa ajụjụ anyị zigara ha banyere etu okwu siri kwụrụ n'ikpe ahụ, ojeozi ụlọikpe ahụ bụ Corinna Rathke gwara BBC Igbo , ""Ihe anyị ga-agwa ụnụ bụ na e wepụla akwụkwọ mgbagha mkpebi niile e nyere na ikpe ahụ. ebe nha ahụ a dara ka kwụchịm."" A nwụchiburu ndị e chere na ha bụ ụmụ afọ Igbo nọ na mba Jamini bụ wakporo Ekweremadu ma tie ya ihe n'afọ 2019. Ndị ụlọikpe ahụ ekweghị agwa BBC Igbo aha ndị ha nyere ntaramaahụhụ maọbụ gbaa foto ha n'anwụ dịka o megidere iwu mba ahụ. Ụlọikpe dara mmadụ anọ wakporo Ekweremadu nha na Jamini Ekweremadu bụbu osote onyeisi Ụlọimeiwu Ukwu Otu ụlọikpe dị na mba Jamini adaala mmadụ anọ wakporo onye omeiwu bụ Ike Ekweremadu n'afọ 2019 nha. N'ozi ha ziteere BBC Igbo ha kọwara na e nyochara ihe mere ọfụma tupu a kpụpụ ndị a ụlọikpe ma daa ha nha. Ozi ahụ kwukwara na mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ na-eme mkpesa maka nha a dara ha. A mabeghi nha ego ole a dara ndị a mana ozi ahụ kwuru na ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka ha ji akwụ ya bụ ụgwọ. Mgbe BBC kpọtụrụ Ekweremadu ịnụ olu ya gbasara okwu a, onye na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichuwku tinyere ọnụ n'okwu a. O kwuru si, ""achọghị m ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu"". Cheta na ndị uweojii n'obodo Nuremberg na Jamini nwụchiri mmadụ anọ maka ebubo mwakpo Ike Ekweremadu n'emume iri ji na mba ahụ. Anyị na-enyocha ndị wakporo Ekweremadu Ndị uweojii mba Jamini ekwuola na ha amalitela inyocha mmadụ anọ maka ihe mere Ike Ekweremadụ n'obodo Nuremberg oge ọ bịara njem n'ala ahụ na nsonso a. Maazị Robert Sandmann, onyeisi nchọpụta ndị uweojii na Jamanị, bụ onye gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nke a. Ọ sị na ndị mmadụ wakporo ma tie Ekweremadu bụ Sinetọ na-anọchite anya Enugwu West n'ụlọomeiwu ihe na Nuremberg, mba Jamini ebe ọ gara Iri Ji ndị Igbo nọ na mba ahụ. Na nzaghachi ozi BBC Igbo zigara ha, ndị isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mittelfranken, Nürnberg kwuru sị: ""N'ezie ihe dịka ihe i kwuru mere n'elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2019 na Nuremberg dị na Schmausenbuckstraße. ""Ndị uweojii gbalịrị ichekwa onye o metụtara ma duru ya gaa n'ụgbọala ya ma sorokwa dulaa ya n'ụlọoriri na nkwari ebe o hiri na Nuremberg. ""Oge ọ na-ala site n'ebe a nọrọ mee emume, a tụrụ akwa n'ụgbọala onye ihe metụtara. ""Ka nke a na-eme, ndị uweojii nyere iwu ka ndị a si ebe ahụ pụọ dịka ha bidorola nnyocha mmadụ anọ."" Ekweremadu bụ onye gbaburu ama ihe mere ya n'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Anichukwu. Ọ bụ ndị Ipob wakporo m - Ekweremadu Ọ sị na Ndigbo nọ ebe ahụ nabatara ya nke ọma rue mgbe ndị sị na ha bụ ndị Ipob bịara bute ọgbaghara ma kwuo na onweghi na emume ahụ agaghị adịzi. ""A chọrọ m ka m rịọ ha mana mgbe ha bidoro ịkpa agwa dị aghaa, e siri m ebe ahụ pụọ site na enyemaka ndị uweojii."" Ihe onyonyo dị na Facebook na-egosi etu ndị mmadụ si kụsasịa emume iri ji ndị Igbo bi n'obodo Nuremberg dị na Jamanị na-eme. Ụfọdụ ihe onyoonyoo a gosikwara ka ndị a wakporo otu onye ha na-akpo ""Ekweremadu"" bịara ya bụ emume. Ihe onyoonyoo a malitere igosi ebe otu nwoke yi uwe isi agụ ojii na achọ ụzọ ịba n'ụlọ emume a ka ọtụtụ mmadụ na-awakpo ya ma gbochiere ya ịba n'ime ụlọ ahụ. Nwoke ahụ mechara dabanye n'ime ụgbọala ya gbalaga ọsọ. Nchọpụta BBC Igbo bụ na obodo Nuremberg bụ ebe ehiwere emume akpọrọ ""Igbo Cultural Festival"" nke afọ 2019. Ike Ekweremadu, bụ omeiwu na-anọchịte Enugwu West so na ndị a na-ele anya ha na ya bu emume dịka ụlọ ntaakụkọ African Courier siri dee. Facebook ndị Igbo Jamanị dekwara na ọ bụ ya bụ isi oche na ya bụ emume. Onye omeiwu na-anọchịte Awgu, Oji River na Aninri n'ụlọ Omeiwu obele bu Toby Okechukwu gwara BBC Igbo na ya so Sịnetọ Ekweremadu ga ya bu emume. ""Ọ bu ndị Ipob mere ihe a. Ka anyị ruru ebe ahụ, anyị hụrụ ha, wee gaa kelee ha."" Maazị Okechukwu sị na ọ bu mgbe ha na-achọzị ịbanye ebe a na-eme ya bụ emume ""ka ndị Ipob ahụ bidoro kpawa agwa ha aghọtaghị."" ""Ha malitere tụwa Sịnetọ Ekweremadu akwa na ihe ndị ọzọ."" Omeiwu Okechukwu si na Sịnetọ Ekweremadu rapụrụ ebe ahụ, mana ndị uweojii mechara bịa jide ụfọdụ n'ime ndị kpara agwa a. Ọ jụkwara ihe mere ndị Ipob ga-eji sị na Ekweremadu bu onye iro ha. ""Ha echefuola na Maaazị Kanu gara be Ekweremadu inye ya ekele maka mbọ ọ gbara mgbe o nọ na mkpọrọ dịka atọhapụrụ ya?"" N'ịgba akaebe ihe Maazị Okechukwu kwuru, ihe onyonyo dị na Facebook gosiri na ụfọdụ so eme mwakpo a yi ọkọlọtọ Ipob. Mana ọkaiwu Paul Achara, onye ya na Nnamdi Kanu na-arụkọ, gwara BBC Igbo na ndị Ipob agaghi emenwu ụdịrị ihe a. Otu n'ime ndị no mgbe mwakpo a na-eme dịka ihe nkiri siri gosi yi okọlọtọ Ipob n'uwe ya Agbanyeghị nke a, Paul Achara bụ onye ya na Maazị Kanu na-arụkọ gwara BBC Igbo na aka Ipob adịghị n'ihe a mere. ""Na mmadụ yi ejirimara Ipob abụghị na onye ahụ onye Ipob."" N'aka nke ọzọ, o kwekwara nkwa na Ipob ga-eme nchopụta ihe mere. ""Yabụrụ na ndi otu anyị mejọrọ, Ipob ga-arịọ mgbaghara dịka anyi mere mgbe ụfọdụ n'ime ha gara ụlọ ụka kpaa agwa ezighi ezi."" Ipob na onwe ha na-eme emume igosi nka metụtara agha Biafra na Naijirịa na obodo Eliza. Ndị a kpara mkpa mkpa na-ekwu n'ime iho onyonyo ndị a na ndị na-eme emume iri ji a na Nuremberg adịghị eche maka ihe na-emegasi n'ala nna ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45440273,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45440273,Nwunye Ojukwu bụ Bianca ga-azọ ọkwa sineti na Anambra South,Nwunye Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu bụ Bianca Odumegwu-Ojukwu esorola na ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na ntuliaka na-abịa.,"Bianca bụ nwunye dike duru ndị biafra gaa agha Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu Bianca gara n'akara Facebook ya taa ikwupụta nkwado ahụ otu a kpọrọ 'Friends of Ambassador Bianca Odumegwu-Ojukwu' nyere ya. O kwuru na ha wuchiri n'isi ụlọọrụ otu pati APGA ma gbatara ya akwụkwọ isonye na ntuliaka ime ụlọ a ga-eme iji kwado maka ntuliaka sineti n'afọ 2019. Content is not available End of Facebook post, 1 Bianca kọwara na ndị otu ahụ kpokọrọ onwe ha ọnụ ma tụkọọ egọ ha gbaara ya akwụkwọ ahụ nke o kwuru gosiri nkwado pụrụiche. O kwuru na nkwado a gosiri na ndị mmadụ nabatara ya nkeọma agbanyeghi nsogbu ọ na-enwebu na mbụ ebe obodo ndị di ya kwuru na ọ gaghị azọlị ọchịchị n'ala ha maka na ọ bụghị onye ala ahụ. N'okwu ya na Facebook; ""Ihe a na-aga n'ihu na-egosi ụdị nnabata ndị okpuru ọchịchị Anambara Saụt nwere n'ebe ọ nọ nakwa ụdị agụụ ha nwere ka ọ nọchịte ha n'ụlọomeiwu sineti. Nke a pụtara na Bianca ga-azọ ọchịchị n'Anambara steeti bụ ala di ya ""Maka ụdị amamihe o nwere site n'ọrụ ya dịka onye nnọchite anya mba Naịjirịa n'ebe dị icheiche, ọ rara ahụ ndị Anambara inweta ụdị mmadụ tozuru ka ya ịnọchite anya ha na sineti."" Akụkọ apụtala na mbụ na ndị Anambara ekweghi ka nwunye Ojukwu zọọ ọchịchị na steeti ahụ maka na ọ bụ onye Enugwu steeti a lụbatara n'Anambara. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43848441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43848441,Sọọsọ ekele ka Alex Iwobi nwere ebe Arsene Wenger nọ,Onye ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Alex Iwobi etoola onye nkuzi ndị Arsenal bụ Arsene Wenger maka aka o nyere iguzobe Alex n'otu egwu bọọlụ ahụ.,"Amabeghi onye ga-anọchi Wenger oge ọ pụrụ Wenger ga-ahapụ ya bụ otu egwu bọọlụ na ngwụcha oge asọmpi a na-agba ugbua dịka ọ nọrọla karịa afọ iri abụọ n'Arsenal. Wenger kwurpụtara ebumnobi ya site na mgbasaozi o nyere ndị ntaakụkọ. Mana Iwobi nọ n'akara Twitter ya wee depụta etu obi dị ya ebe Wenger nọ ọkachasị etu Wenger siri nyee aka we guzobe ya n'otu egwu bọọlụ Arsenal. N'okwu ya ""Maka ihe niile i meere ndị egwu bọọlụ Arsenal, maka inwe ntụkwasị obi n'ebe m nọ dịka nwa na-etolite etolite, maka inye m ohere igosipụa onwe m ma tokwa dịka onye ọgba bọọlụ nakwa dịka mmadụ, a ga m na-ekele gị bu onyeisi m ebighebi. Daalụ rnke ukwuu!"" O tinyere akara nke na-egosi ịhụnanya na ya bụ ihe o dere. Iwobi bụ otu onye nime ụmụ na-etolite etolite nke Wenger kuziri ndị si n'ụlọakwụkwọ nke ndị Arsenal wee banye n'otu egwu bọọlụ ahụ nke mbụ. Iwobi banyere Arsenal dịka nwantakịrị na-agụ prayimarị ma sonyere ndị otu mbụ ha n'afọ 2013 dịka onye ga-anọchi mmadụ n'asọmpi ha na West Bromwich Albion gbara. Wenger buru iko Premia Lig atọ na FA asaa nime afọ iri abụọ na abụọ ọ nọ n'Arsenal. O nwere ike inweta iko mba Europe ya nke mbụ tupu o pụọ dịka otu ahụ nọ n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi UEFA Yuropa Lig. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54352100,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54352100,"Agbawatụla gị obi maka ịhụnanya, lee etu ị ga-esi chịkọta onwe gị",Ị hụtụla onwe gị ebe ọ dị ka ụwa gị agwụla n'ihi na onye ị hụrụ n'anya (enyi gị nwoke maọbụ nwaanyị) gbawara gị obi?,"Kedụ ihe ị mere oge ahụ? Ị hapụrụ ka echiche ụwa dakwasị gị ka ị chọrọ ụzọ dọpụta onwe gị? Ọtụtụ ndị ji echiche na ihe ga-agara ha nke ọma, na ha nwereike imecha lụọ onye ha zutere banye n'ime ọyị, mana o mezughi n'ikpeazụ. Ebe ụfọdụ mechara jide obi ha aka, ụfọdụ emeela ihe a tụwaghị anya dịka ịma ụma emerụ onwe ha ahụ maọbụ gbuo onwe ha n'ihi ya. Lee etu ị ga-esi dọpụta onwe gị n'ọnọdụ ahụ. 1) Mara na ụwa gị agwụbeghi: Na onye ị hụrụ n'anya jụrụ gị abụghị na ị ga-ajụ onwe gị. Ị gaghị anwụ n'ihi na ọ dị gị n'obi sị gị na ọ chọghịzị ihe jikọrọ unu abụọ, kama ihe ị kwesịrị ime bụ ịchịkọta onwe gị ọnụ n'ụdịrị oge a. Bee akwa ma ọ gụọ gị, gụọ egwu ""ụwa mụ oo, gịnị ka m mere ụwa?"", mee ihe ọbụla ị chọrọ ime, mana mee ya ọsịsọ, kụchasịa ike gị ma bilie gawa n'ihi na ụwa na-eche ka ị gosi ha dike ị bụ. 2) Atala onwe gị ụta Otu ihe ọma ị ga-emere onwe gị bụ ịkwụsị ịta onwe gị ụta. Kwụsị ịgwa onwe gị na ọ bụ gị metere ihe onye a ji hapụ gị, na ọ bụ gị metere ihe e jiri gbawaa gị obi etu a. O sighi gị n'aka nwanne, gwa onwe gị na ebe ọ na-adabaraghị gị na onye a, ọ ga-adabara gị na onye ọzọ. N'otu aka ahụ, were ihe ị mụtara na mmekọrịta gị na onye nke a hapụrụ gị, mara etu ị ga-esi ṅogharịa ya tupu ị banye n'ime ọyị ọzọ. 3) Pụta n'oke echiche Ị nọrọ n'ebe ndị mmadụ nọ, ọ ga-ara gị ahụ ịbanye n'echiche ebe ị nwereike ị na-ajụ onwe gị ""kedụ ihe m mere onye a? Kedụ ihe m tinyere onwe m na ya?"" Ndị ọkachamara n'ihe gbasara akparamagwa mmadụ ekwuola na usoro e si eru uju ruru ụzọ ise. A bịa n'ihe gbasara mgbawa obi, ụzọ ise ahụ dabara n'usoro ya bụ iru uju nke gụnyere Ọ dịkwa ezigbo mkpa ịma na onye ọbụla anaghị enwekwa otu ụdịrị ahụmihe; iru uju na-emetụta mmadụ n'ụzọ dị iche iche. Marakwa na o wụghị mmadụ niile na-esi n'olulu iru uju a apụta ọsịsọ, ya mere, ị nweta onwe gị n'ọnọdụ a, ị nwereike ịgakwuru ndị ọkammụta n'ihe gbasara ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ ka ha nyere gị aka si na ya rịpụta." 51917740,https://www.bbc.com/igbo/51917740,Explosion in Lagos: Anụtụbeghi m ụdịrị ụda ahụ mbụ,Ndị ọkụ ogbụgba gbara mpaghara Abule Ado dị na Legọs metụtara akọwala etu o ji malite nakwa ụzọ o si metụta ha.,Otu nwoke sị na ụdị ụda ọ nụrụ n'ụtụtụ ahụ na ọ nụtụbeghi ya na ndụ ya mbụ. Ọ sị na ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ọgbaghaara na amaghị ihe ha ga-eme. Ọ sị na ọtụtụ n'ime ndị a gbacha ọtọ kama na o jisiri ike chịkọta ezinaụlọ ya. Otu nwoke ọzọ sị na onye sista na onye fada n'otu ụlọakwụkwọ nọ ebe ahụ nwụrụ ka ha na-achọ ịzọpụta ụmụakwụkwọ ha. Ọ gara n'ihu kwuo na o chere na ọ bụ otu ụgbọala tipa tọrọ atọ butere ọkụ a gbara. Cheta na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ogbunigwe butere nke a mana gọọmentị Legọs steeti sị na ha ka na-eme nyocha banyere ya. Kirie ya n'uju ebe a. 43586195,https://www.bbc.com/igbo/43586195,"N'Enugwu, e ji ofufe nro Tọọsde dị asọ akwado Ista","Ndi ụka Katolik na-akpokwa ụbọchi tata, 'Chrism Mass', na bekee mgbe e ji agozi mmanụ nke ndị ụkọchukwu ji arụ ọrụ.","Tọọsde dị asọ bụ emume ndị Na Holy Ghost Cathedral dị n' Ogui Enugwu, ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ e chiri echichi n'ụka zukoro ọnụ n' ọgba ụlụka ahụ ebe onyeisi nchụ aja bụ Bishop Callistus Onaga duru ha na emume ikwenwo nkwa echichi ha. N'okwuchukwu ya, Bishop Onaga bụ onye na-achịkọta Enugwu Diocese gwara ndị ụkọchukwu ka ha na- eso ukporo Kraistị dobere ndị echichi, nke gunyere umeala, ịhụnanya, inyere ndị mmadụ aka nakwa idobe iwu nke Chukwu ruo n' isi. Ọ gwakwa ndị ụka ka ha kwụsị ịkpa oke agbụrụ n'ụlọụka. Kirima gee ihe Ọnaga kwuru n'uju: Ihe Bishop Callistus Onaga gwara ndị ụkọchukwu na ndị ụka Onaga nọkwa na ya bụ ofufe nro gọzie mmanụ Krizim e ji echi echichi n'ụka, nakwa mmanụ kathekumen e ji anabata ndị ọhụrụ n'ụka. Ndị mmadụ karịrị nari ise bụ ndị gbakọbara na ya bụ Holy Ghost Cathedral iji sonye mmemme 'Holy Thursday' bu otu na ihe a na-eme na izuụka dị asọ were kwadebe maka Ista. Bishop Onaga chetakwara ndị mmadụ ka ha gaa weta akwụkwọ ntuliaka ha, n'ihi na ọ bụ ya ga-enye ha ọnụokwu na ihọta ezi onye ọchịchị. Tọọsde dị asọ bụ emume ndị Ndi ụka Katolik na-akpokwa ụbọchi tata, 'Chrism Mass', na bekee mgbe e ji agozi mmanụ nke ndị ụkọchukwu ji arụ ọrụ. Na Holy Ghost Cathedral dị n' Ogui Enugwu, ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ e chiri echichi n'ụka zukoro ọnụ n' ọgba ụlụka ahụ ebe onyeisi nchụ aja bụ Bishop Callistus Onaga duru ha na emume ikwenwo nkwa echichi ha. N'okwuchukwu ya, Bishop Onaga bụ onye na-achịkọta Enugwu Diocese gwara ndị ụkọchukwu ka ha na- eso ukporo Kraistị dobere ndị echichi, nke gunyere umeala, ịhụnanya, inyere ndị mmadụ aka nakwa idobe iwu nke Chukwu ruo n' isi. Ọ gwakwa ndị ụka ka ha kwụsị ịkpa oke agbụrụ n'ụlọụka. Kirima gee ihe Ọnaga kwuru n'uju: Ihe Bishop Callistus Onaga gwara ndị ụkọchukwu na ndị ụka Onaga nọkwa na ya bụ ofufe nro gọzie mmanụ Krizim e ji echi echichi n'ụka, nakwa mmanụ kathekumen e ji anabata ndị ọhụrụ n'ụka. Ndị mmadụ karịrị nari ise bụ ndị gbakọbara na ya bụ Holy Ghost Cathedral iji sonye mmemme 'Holy Thursday' bu otu na ihe a na-eme na izuụka dị asọ were kwadebe maka Ista. Bishop Onaga chetakwara ndị mmadụ ka ha gaa weta akwụkwọ ntuliaka ha, n'ihi na ọ bụ ya ga-enye ha ọnụokwu na ihọta ezi onye ọchịchị. Ụbọchị Tọọsde dị asọ bụ ụbọchị a na-echeta oriri ikpeazụ Kraist na ụmụazụ ya" afirika-51901150,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51901150,House Rent: Lekwa ebe ụgwọ ụlọ kacha dị ọnụala na mpaghara ọwụwa anyanwụ,"Ihe atọ kachasị mmadụ mkpa n'ụwa a bụ nri oriri, akwa oyiyi na ụlọ obibi.","Mana ọbụghị mmadụ niile na-ahụ ebe ha ga-edebe isi n'ihi oke ọnụ ụgwọ ụlọ n'ada. N'obodo niile mepere emepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ịkwụ ụgwọ ụlọ abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba. Mana kedu ebe ụgwọ ụlọ kacha ada ọnụ? BBC Igbo bara n'ahịa ịmata nke ekwe na-akụ. Ajụjụ anyị bụ: Kedu ebe ụgwọ ụlọ ihe dịka ọnụụlọ atọ (three-bedroom) kacha galaa ọnụ n'ala Igbo? Enugwu N'ebe dịka GRA maọbụ 'Independence Layout', ụgwọụlọ maka ọnụ ụlọ atọ ahụ dị ga-ebido na puku 800 ruo otu nde naịra maka otu afọ. Na 'New Heaven', ego ya ga-eru bido na puku 500 ruo puku 650. Mana ị gaa n'akụkụ Achara Layout maọbụ Trans-Ekulu, ọ ga-abụ ihe dịka puku 300 maọbụ 350. Ọnịcha Ụlọelu bụ ihe e ji mara Ọnịcha Nnamdị Obiejesi onye oji ego achụ ego na otu nkwọ Ọnịcha, kwuru na ụgwọ otu afọ maka ọnụ ụlọ atọ ga-eru puku 700 maka ụlọ ọhụrụ, maọbụ puku 400 maka ụlọ ochie na mpaghara GRA Ọnịcha. Mana ụlọ di etu ahụ na mpaghara 'Housing Estate' dị na Three-three ga-abụ ebe puku 350 maọbụ 400. N'Awada, Ugwuagba Obosi, Oba, ego ọnụ ụlọ atọ bụ bido na puku 250 ruo 300. Owerri Owere bụ obodo e ji ikpori ndụ mara, nke mere ọtụtụ ji echu ya ka mmiri. Mana ịkwụ ụgwọ ụlọ ebe ahụ abụghị atọ kọbọ. Ịchọta ọnụ ụlọ ato na mpaghara Ikenegbu, 'Concorde' maọbụ Spillberg ga-efu gị bido na puku 600 ruo 800. I gaa na mpaghara Ọjị, 'Okigwe Road', Amakọhịa, Obinze, dịrị gawa, ị ga-enweta ọnụ ụlọ atọ a rụrụ ochie n'ọnụ puku 300 ruo 350. Mana ụlọ ọhụrụ anaghị adị ala karịa puku 400. Abakiliki BBC Igbo jụrụ ese wee chọpụta na ụgwọ ọnụụlọ atọ na mpaghara GRA nke Abakiliki bụ bido na puku naịra 500 ruo otu nde. Mana ebe ndị ọzọ dịka Azuiyiokwu, 'New Layout', 'Mile fifty' dịrị gawa, bụ bido na puku naịra 300 ruo 400. Awka Ebe ụgwọ ụlọ ka ada ọnụ n'Awka bụ na mpaghara Agu Awka. N'ebe ahụ, ọnụ ụlọ atọ kwụ chịm bụ bido na puku 600 ruo puku 800. Ụlọ ochie dị ebe ahụ bụ bido na puku 400 ruo puku 450. Ebe dị ka 'Awka town' bụ puku 300 maọbụ puku 350. Mana ịbanye n'ime Amọbịa, Amansii, dịrị gawa, mmadụ nwere ike inweta ọnụ ụlọ atọ maka puku 250. Aba Na mpaghara 'Aba-Owerri road', 'Okigwe road' Ekenna, ọnụụlọ atọ nwere ike ịbụ malite na puku 400 ruo 600. N'Ọgbọ hill, Ngwa road, Umuode, dịrị gawa, ọnụụlọ atọ bụ malite na puku 130 ruo 200. Cheta na ụlọ ọhụrụ na-aka ụlọ ochie ada ọnụ. Nnyocha BBC gosiri na ịkwụ ụgwọ ụlọ n'Enugwu abụghị ihe ụmụaka. Anyị chọpụtakwara na ebe ndị na-akpọtụ akpọtụ n'Owerri abụghịkwa obere ego. Abakiliki na Ọka sokwa na-ebe okwu na-agala ọnụ. Mana ị gaa Aba, Ọnịcha, maọbụ Ụmụahịa, ebe ahụ ka ụlkọ kacha ọnụ ala. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Amputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'" 44759394,https://www.bbc.com/igbo/44759394,Ahụrụ ili nwaagbọghọ a n'okpuru akwa enyi ya nwoke,Ka ọ gachara abalị atọ achọwara Adenike Khadijat Oluboyo ka ndị ụweojii hụrụ ozu ya na ụlọ enyi ya nwoke bụ Adeyemi Alao ebe ha sị na o niri ya na'okpuru akwa ya.,Adenike Khadijat Oluboyo na-agụbu akwụkwọ na Adekunle Ajasin University bụ ebe o kwesiri ịpụta n'afọ ọzọ. Ihe a mere na Adekunle Ajasin University bụ ebe nwa agbọghọ a na-aga akwụkwọ bụ nke ọ nọ n'afọ nke anọ ya. Ndị uweojii gwara BBC na ha magidere imi n'ala were gwuputa ozu Khadijat Oluboyo na ili ebe Adeyemi Alao niri ya n'ime ụlọ ya nke ndị na Akure. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti bụ Femi Joseph kwuru na ndị be Khadijat Oluboyo nke bụ nwa osote gọọvanọ ndị Ondo steeti chiburu nọ na afọ nke anọ ya n'ụlọ akwụkwọ mahadum AAU. Adenike Khadijat Oluboyo Okwukwere na oteele ndị be ha chọwara ya bụ nwaada achọ. Joseph kwukwara na aka ha akpalara Alao bụ onye a na ebo ebubo a ma n'emekwa nnyocha dị na ya. Okwekwara nkwa na ha ga na agwa BBC okwu dị ihe si apụta na ya bụ ihe. Adenike Khadijat Oluboyo bụ nwa Lasisi Oluboyo nke bụbu osote aka na achị Ondo steeti mbu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Akụkọ kachasị tata Akụkọ kachasị n'abalị a: Nwaagbọghọ nwụrụ n'ụlọ enyi ya nwoke afirika-43298744,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43298744,Ọgbaghara Taraba: Ghọta nụ na m na-arụ ọrụ - Buhari,Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụghị ebe ọbụla ọgbaaghara dị ka ọ ga-aga.,"O kwuru nke a ebe ọ gara ileta ndị Taraba steeti ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'ihe ike mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo ahụ. Ọ sị na-ọdịghị mfe ị ga-ebe niile ihe mere n'ala Naịjiria ebe ọ bụ na o nwere ndị na-ewetara ya akụkọ ihe na-aga n'ala. Ọ sị kwa na ihe mere oji gaa Taraba steeti bụ na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ebe ahụ kacha ndị nke Benue na ndị Zamfara steeti. Mambila bụ ebe ọhụrụ enwere mwakpo n'etiti ndị ọchịehi na ndị mmadụ Onye enyemaka Gọvanọ na-achị Benue steeti gwara BBC n'elu ekwentị na ha amabeghị mgbe onyeisiala ga-abịara ha mgbaru ụlọakwa ka o sị kwuo. Mana ọ sị kwa na ha nwere olileanya na ọ ga-abụ mgbe Buhari ga-esi Ghana lọta. BBC gbalịrị ịnweta Lai Mohammed n'ekwentị mana ka-anyị na-ede akụkọ a, onwebeghị isi. Cheta nụ na ihe karịrị mmadụ iri nwụrụ n'ihe a mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo Mambila n'ọtụtụ ụbọchị gara aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44593276,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44593276,Saudi Arabia News: Ihe 5 ụmụnwaanyị Igbo na-eme ndị Saudi Arabia anaghị emenwu,Mohammed bin Salman bụ onye ọchịchị mba Sawudi Arebia ka na-aga n'ihu ime ụmụnwaanyị mba ya obi ọma dịka ha na-ebuli ọtụtụ iwu e jibu machie ha.,"N'ụbọchị Fraịdee, ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst 2019, e wepụtara iwu ọhụrụ nyere ha ohere ime ụfọdụ ihe ha anaghị emebu. Ihe ndị a gụnyere ime njem si na mba fere na mba na-ebughi ụzọ nata nwoke ọbụla ikike, ịgba alụkwaghịm, iji aka ha tinye akwụkwọ maka nwa ọhụrụ a mụrụ, alụmdinanwunye nakwa ihe ndị ọzọ. Mana ị ma na e nwere ihe ole na ole ụmụnwaanyị Igbo nwere ohere ime ndị nke si Sawudi Arebia agaghị emenwu? Mba Sawudi Arebia bụ mba ndị alakụba kachasị, nke mere na ha nwere ụfọdụ iwu ndị machiri ụmụnwaanyị ha ime ihe ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ na gburugburu ụwa na-emenwu. Ọtụtụ n'ime ihe na-anaghị eru ha aka maka na a napụrụ ha ikike iji mee ya, bụ ihe ndị ụmụnwaanyị Igbo na-emecha tinye 'jara'. N'etiti ụmụnwaanyị Igbo na ndị Sawudi Arebia BBC Igbo na-atụnyere ihe dị iche n'etiti ndụ ụmụnwaanyị Igbo na ụmụnwaanyị ndị Sawudi Arebia. 1. Ime njem Ọtụtụ ụmụnwaanyị Igbo na-eme njem etu ọ masịrị ha, mana ọ dịbughi etu ahụ nye ụmụnwaanyị Sawudi Arebia. Tupu e bulie iwu e buliri n'ọnwa Ọgọst 2019, nwaanyị anaghị eme njem na mba ahụ maọbụghị ma nwoke 'a ga-emere ya mkpebi', kwenye na ọ ga-aga. Tupu nwaanyị enwetakwa akwụkwọ ikike e ji eme ya bụ njem nke Bekee kpọrọ 'passport', nwoke (nwere ike ịbụdị ma onye ọ tọrọ atọ) ga-ekwenyekwa. 2. Ịnya ụgbọala: Tupu Juun 24 2018 eruo, iwu machiri ụmụnwaanyị Sawudi Arebia ịnya ụgbọala n'obodo ha. Mana ụmụnwaanyị Igbo ịnya ụgbọala abụghị ihe ọhụrụ. Ụfọdụ n'ime ha, ọ bụ di ha na-azụtara ha ụgbọala iji gosipụta ọkwa ha ma mee ""ị makwa ndị anyị bụ"" ma ha zute ibe ha. 3. Iyi uwe masịrị ha: Mgbe gboo, ụmụnwaanyị Igbo na-ama akwa n'obi mana ekwesịghị ịhụ obi na olu ụmụnwaanyị Sawudi Arebia anya Ebe ụmụnwaanyị Igbo nwere ike iyi ihe ọbụla masịrị ha ma ọ bụrụhaala na ha agbaghị ọtọ, ọ dịrịghị ndị nke Sawudi Arebia etu ahụ. Ruo echi, iwu ka machibidoro ha iyi uwe ga-egosi ụkwụ ha. Ụfọdụ, a gaghị ahụ ntutuisi ha anya, ebe ụfọdụ na-ekpuchi ahụ ha niile hapụ naanị anya ha. Ha nwere uwe a na-akpọ ""abaya"" ha na-eyikarị maka nke a. 4. Nwoke na nwanyị ịnọkọ Ebe ụmụnwaanyị Igbo na ụmụnwoke nwere ike ịnọ ebe masịrị ha na etu masịrị ha, iwu machibidoro ụmụnwaanyị Sawudi ime etu ahụ. E wepụ izute n'ụlọọgwụ, ụlọakụ na ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ maka nlekọta na ahụike, iwu machiri ha na nwoke ịnọkọ. Nsonso a ka e bidoro ịhapụ ụmụnwaanyị ịbata n'ogige egwuregwu nke Bekee kpọrọ ""stadium"" dị n'obodo Dammam, Jeddah na Riyadh dị na mba ahụ. 5. Inweta akara ụlọakụ A bịa n'ala Igbo, ụmụnwaanyị nwere ihe Bekee kpọrọ ""account"" n'ụlọakụ. Ọtụtụ nwere ihe karịrị otu, mana ọ dịrịghị ụmụnwaanyị ibe ha na Sawudi mfe etu a. Tupu ị nweta akara ụlọakụ, nwoke na-emere gị mkpebi nke bekee kpọrọ ""guardian"", site n'iso gị aga maọbụ ide akwụkwọ nkwenye. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" media-46860958,https://www.bbc.com/igbo/media-46860958,Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala,Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala,"Akụkọ dị mkpa: Ndọrọndọrọ ma Theresa May ọ ga-aga n'ihu ịrụ dịka onyeisiala mba Briten bere n'abalị Wenezde dịka ndị omeiwu mmadụ 325 tụnyere ya ka ọ nọrọ ,ebe mmadụ 306 kwuru ka o rituo. Ndọrọndọọ ahụ bidoro ụbọchị Tuzde oge ọtụtụ ndị omeiwu mba tụrụ vootu megide Briten ịpụ na European Union. Ndị ụlọomeiwu mba Briten ajula ibinye aka ka ha pụọ n'otu EU Ndị ụlomeiwu mba Briten mmadụ 202 kwenyere ka ha pụọ , ebe mmadụ 432 jụrụ. Onye ndu otu Labour pati n'ụlọomewu bụ Jeremy Corbyn welitere okwu 'enweghị ntụkwasaobi' na Theresa May, nke nwere ike kpalite okwu ntuliaka na oge na adịghị anya. Corby ibinye aka na vootu 'eenweghị ntụkwasaobi' ga-enye ụlọomeiwu ohere inwe mkpebi maka 'amaghị ọrụ' nke ọchịchị May. Theresa May kwuru na na ya ga-ewepụta ohere maka ndọrịtaụka n'okwu a akpụ n'ọnụ. Mohammed Adamu ebidola ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria Mohammed Adamu amalitela ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria dịka onyeisiala Naijiria tunyechara(decorated) ya ugo pụrụ iche. Ibrahim Idris onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naijiria lara ezumike taa bụ Tuzde, abali iri na ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 2019 ka ọ nọzuru oge ya n'ọrụ oyibo dịka iwu Naịjirịa si kwuo. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Jimoh Moshood kwuru na onyeisiala bụ Muhammadu Buhari enyela iwu ka Mohammed Adamu bu osote onyeisi nji uweojii bido na-arụ dịka onyeisi ha. Idris kelere onyeisiala nakwa ụmụ Naijiria maka nkwado ha. Ibrahim Idris onyeisi ndị Uweojii Onye bụ Mohammed Adamụ? Mohammed Adamu bụ onye Lafia dị na Nasarawa steeti banyere ọrụ uweojii dịka 'Cadet"" n'afọ 1986 ebe o siri were gbalite n'ọkwa oosote onyeisi ndị uweojii. Ọ gara onye garala ọtụtụ ọzụzụ ndị uwe ojii na Najiria na mba ofesi rụụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii nke Ekiti nakwa Enugwu steeti. A wakpola otu ụlọ oriri na nkwari na Nairobi A wakpola otu ụlọ oriri na nkwari n'isi obodo Kenya bụ Nairobi. Ihe ruru ogbunigwe abụọ gbara n'ebe ahụ ebe a nụkwara ụda egbe n'ebe ahụ dị n'akụkụ Westland ebe e nwere ụlọọrụ ndị mmaọ̄ụ nakwa ụlọ oriri na nkwari. Ndi hụrụ ka ihe a mere kwuru na ha hụrụ mmadụ anọ bu ngwaagha ebe ha na-aba ụlọ ahụ ebe ha gbara ọtụtụ ụgbọala ọkụ. A na-akpọpụta nd mmaọ̄ụ n'ime ụlọ ahụ dịka ndị uweojii gbochiri ebe ahụ ma na-agba mbọ ịgbapụta ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ. A mabeghi ndị mere ihe a. A gbara ụgbọala PDP iii ọkụ n'Enugwu Ụgbọala isii nke ndị otu pati PDP gụnyere Sienna bus atọ na Coaster bus atọ nke ebiri ọkọlọtọ ndị PDP ma dọta ya n'otu ụlọ dị n'Osadebe streetị Ogui New Layout, na ncherita ihu WTC Enugwu. Dịka onye n'ekwuchitere ndị uwe ojii ọnụ ha n'Enugwu bụ Ebere Amarizu siri kwuo onweghị onye mara ka ya bụ ọkụ siri malite ma gbapịa ụgbọala ndị ahụ.Amarizu kwuru na ọ bụ enyemaka ngwangwa ndị uwe ojii nakwa ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ Fire Service mere na ya bụ nnukwu ọkụ abaghị n'ụlọ gbara ogige ahụ gburu gburu. O sikwa na otu aka ahụ rịọ ndị mmadụ ka ha mara na ugbua bụ oge ọkụ ọgbụgba ji akpa ike, n'ihi ya onye ọbụla kwesiri igbochi ụzọ ọbụla ọkụ nwere ike iji ghọrọ ụlọ ma ọ bụ ngwongwo. Ekweremadu sị na ya na akwadosi PDP ike Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata Ana m akwado mmeri PDP na ntuliaka 2019. Ike Ekweremadu bụ onye ana ebo ebubo na uche ya adịghịzi na PDP kwuru nke a ụbọchị Monde mgbe okwuru na ya na Peter Obi na ndị gọọvamọ ọwụwaanyụ enwela ọtụtụ nzụkọ maka nke a. Idris gbara afọ iri isii taa nke bụ na o kwesiri ịla ezumike nka mana kepukepu na-ekwu na gọọmenti etiti nwere ike ịgbatikwu oge ya. Ịkpata mpekele ihe eji eme ntuliaka ga-ebe na 8 Febuwari Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka Independent Electoral Commission INEC ekwuola na ụbọchị ikpeazụ aga akwụsi ịnye akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka bụ PVC bụ na mkpụrụ ụbọchị asatọ (8) nke Febuwari. N'aka ọzọ INEC ewuchiela ekwentị maọbụ ihe ọbụal eji ese foto na ebe ana atụ vootu dika onyeisioche ha na Kano steeti bụ Okamuta Riskuwa Shehu si kwuo. Ụwaagbaa""Theresa"" gharịị maka Brexit N'ofesi, oruola ka aga amata ebe ọsụ ụtara dowere ọdụ na amụma Brexit nke mba Briten. Theresa May bụ onyeisi obodo ahụ na-arịọ ndị pati ya ha ekwela ka ihere mee ha site na-ịme ka ya bụ Brexit kpụọ afọ n'ala. Serena bụ ọkaibe na Australia Open Serena williams Agụ nwaanyị tenis bụ Serena Williams egosila na ya bụ agadị anaghị aka nka na egwu ọmaara agba sịte na-imeri Tatjana Maria na Australia Open. Serena gbara afọ iri atọ na asaa ga-enweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ (24) ma ọ nweta mmeri nke agba abụọ a ọ banyere. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri Eze Kaduna: Ndị Igbo nọrọ ebe ọbụla ha denyere aha tuọ vootu Akụkọ kachasi" afirika-44328334,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44328334,Benue: ọchịehị egbuola ndị mmadụ ọzọ?,Ndị uweojii na Benue ekwuola na ndị omekome ataala isi ihe ruru mmadụ asaa (7) ma merukwa mmadụ isii (6) ndị ọzọ ahụ na Tse Adough dị na okpuru ọchịchị Kwande n'ụtụtụ ụbọchị ụka.,"Onyeisi ndị uweojii na Benue, Fatai Owoseni Ndị uweojii kwuputara nke a n'akwụkwọ ha biputara ndị ntaakụkọ ebe ha kwuru na ndị omekaome a gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ. Ha sịkwa na-achọtala nwa nwaanyị ahụ nke a na-eche ndị mmgbuisi a tọrọ. Ha sịkwa na ""ha na-agba mbọ ihụ na ha jidere ndị mere mpụ a ebe ha gbara mbọ iweta ezi nchekwa na obodo ihe ndị a metutere. N'aka ọzọ akwụkwọ ha, The Guardian dere na ọ bụ mmadụ 10 nwuru na ya bụ mwakpọ ebe mmadụ 15 meruru ahụ. Akwụkwọ ntaakụkọ a kwukwara n'ọtụ nwoke ji obere ihe gbalahụ ọnwụ bụ onye sị na ha nọ n'ụra mgbe ndị omekome a wakporo ha n'isi ụtụtụ ụnyahụ na-agbaghị ama ọbụla. Gọọmentị agbọbeghị ndị ọchịehi otu iyi egwu Onyeisi okpuruochịchị ime obodo bụ Terdoo Nyor Kenti bere arịarị na a n'egbu ndị be ha na-emeghị nta na-emeghị imo. Ọkwukwara n'ahụrụ ozu ndị mmadụ ruru asaa ma merukwa isii ahụ. Ndị uweojii Benue kwukwara n'otu isi ụtụtụ ahụ mkpamkpa hụ kpara na ndị otu nzuzo abụọ kpọrọ onwe ha Black Skin na Red Skin gwọrọ onwe ha ji mmanu ụbọchị ahụ ebe isi mmadụ abụọ nara ma otu onye meruru ahụ. Ndị uweojii sị na-ama agbara ha mere eji jide mmadụ iri na ise (15) ebe mmadụ asaa (7) n'ime ha bụ ndị otu nzuzo a. Ha kelekwara ndị obodo marịọkwa ka ha tinye aka n'ịgba ama maka ndị ọjọọ nakwa agwa rụrụ arụ. ""Ọhụrụ kwuo"", dịka ha sị tinye ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51400947,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400947,Female Genital Mutilation: 'A na-erosi m iro makana a chọrọ m ka a kwụsị ibi nwaanyị ugwu',"N'Ikwo dị na Ebonyi steeti, aha Mary Odumeke bụ ihe ọtụtụ ụmụnwaanyi ma.","Ufọdụ bụ maka na ọ gbapụtara ha n'aka nne na nna ha chọrọ ka e bie ha ugwu. Ndị ọzọ bụ na ndị ọ lụụrụ ọgụ oge ọ chọpụtara na e biri ha ugwu. Na ihe nkiri a, Odoziakụ Odumeke kowaara BBC Igbo etu o si malite atumatu a, nakwa etu ụfọdụ mmadụ si na-ebuso ya agha maka ya. Ọ kọwakwara na ya agaghi akwụsị ịgba mbị ịhụ na ihe a ọ sị na ọ dịghị nwaanyị mma n'ahụ kwụsịrị kpam kpam. Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47222779,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47222779,"Man United vs PSG: Ike 'ekwensu ọbara ọbara' dara, ike PSG eguzoro","Otu PSG tiri Man Utd mmọnwụ, iji gosi ha na ha abịaghị igwu egwu, ka ha ji goolu abụọ merie ha na Old Trafford.","Nke a bụ mmeri mbụ a na-emeri otu egwu bọọlụ Man Utd kemgbe Ole Gunna Solskjaer malitere ịchịkọta ha. Presnel Kimpembe ji ha gbachara ọnụ ma gbaa aka ahịa, n'ihe bụ goolu mbụ ọ na-enyere ndị PSG. Kylian Mbappe dọkara neetị David De Gea n'ọkara nke abụọ, ebe e mechara chụpụ Paul Pogba ka o nwetara akwụkwọ edo edo abụọ. Angel Di Maria gbabuuru Man Utd bọọlụ eleghi anya n'azụ ka ọ na-agwọ ha ara n'agbanyeghi emu ha nọ na-akwa ya; o bunyere Kimpembe bọọlụ o ji nye goolu. Anthony Martial na Jesse Lingard merụrụ ahụ n'ọkara mbụ, mere ka ewepụ ha. Ajụjụ onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ ""isi Man Utd a ga-apụtakwa mgbe ha ga-aga na Parc des Princes n'ụbọchị isii nke ọnwa Maachị?"" Ihe mberede okporoụzọ mere n'Imo steeti:Ụgbọala Tipa dakwasịrị ma kurie otu ụgbọala Pasat bụ nke otu pati APC ji achụ nta vootu n'Owere bụ isi obodo Imo steeti. Ihe mberede a mere n'okporoụzọ akpọrọ Jacob Zuma bụkwa nke e ji ""akanchawa"" wee mara.Anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Igbo na ihe mberede a mere ka obere ụgbọala a e ji achụ nta vootu nke Muhammadu Buhari nakwa Rochas Okorocha, chọrọ igbafe ụgbọala Tipa ahụ.O kwuru na onweghi onye nwụrụ, mana e burula onye ọkwọụgbọala ahụ gawa n'ụlọọgwụ makana ọ merụrụ nnukwute ahụ. Nnamdi Kanu na BBC: Na mkparịtaụka Nnamdi Kanu na BBC Igbo nwere, o kwuru na ihe ọ gabigara n'aka ndị agha mere o ji zoo mgbe ahụ o zoro. O bokwara ndị na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ ebubo na ha chọrọ igbu ya n'afọ gara aga, so mee o ji gbaa ọsọ, gaa lekọta onwe ya n'ahụ ọ merụrụ. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a: Nnamdi Kanu na BBC Igbo Udo ga-achị n'Imo steeti: Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti ebinyela aka n'akwụkwọ udo, ebe ha kwenyere na udo ga-achị na ntuliaka na-abịa. Ndị otu ọrụ nchekwa niile nọ n'Imo steeti nke gụnyere ndị uweojii, haziri emume a. Uche Nwosu nke AA so binye aka Ndị binyere aka n'akwụkwọ udo a gụnyere: Emeka Ihedioha nke PDP, Uche Nwosu nke AA, Linus Okorie nke YPP, Tony Nwulu nke UPP nakwa ụfọdụ ndị ọzọ. Tony Nwulu nke YPP bịakwara Ikedi Ohakim nke pati Accord, Hope Uzodimma nke APC nakwa Ifeanyi Araraume nke APGA bụ ndị osote ha nọchiri anya ha na mmemme ahụ. Emeka Ihedioha nke PDP binyekwara aka Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Dasuki Galadanchi, n'ozi nnabata ya, gwara ndị na-azọ ọkwa ka ha cheta na ha enweghi steeti ọzọ karịa Imo, ma dụzie ha ọdụ ka ha jiri udo kpọrọ ihe. N'ofesi, Ụlọikpe dị na mba Amerịka achọtala ihe n'aka Joaquin Guzman bụ onye mba Mexico na-atụ mgbere ọgwụ ike a ma dị ka El Chapo. N'agbanyeghi na a mabeghi ya ikpe, a na-ekwu na e nwereike ịtụ ya nga mkpụrụọka ga-eme ka ọ nọgide n'ụlọmkpọrọ ruo oge ọnwụ ya. Gee nkeji BBC Igbo ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa: Nnamdi Kanu na BBC Igbo" 45807481,https://www.bbc.com/igbo/45807481,2019 Election : Onyeisiala ga-edozi akụnaụba Naijiria kachasị mkpa - OBJ,Onye chiburu dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola n'ala a chọrọ onye mara maka ihe gbasara akụnụba nke ọma.,"Olusegun Obasanjo chịburuụ dịka onyeisiala Naịjirịa afọ asatọ bido n'afọ 1999 O kwuru na o nweghị ka onye enweghị nghọta maka akụnaụba Naijiria ga-esi emeta ndị ọ na-achị mma. Ọbasanjo kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ụka Foursquare Gospel Church nwere n'isi ụlọụka ha dị na Yaba, Legọs. O nweghị onye Obasanjo kpọrọ aha n'ọkwụ ya mana ọ katọbuola onyeisiala Muhammadu Buhari ugboro ugboro dịka o siri gbasa akụnaụba Naịjirịa. O degaburu Buhari akwụkwọ ozi n'afọ gara aga gwa ya ka ọ ghara ịzọ ọkwa ọchịchị na 2019 n'ihi, n'uche ya, okwu akụnaụba edoghị Buhari anya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52830965,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52830965,Biafra sit at home: Ihe mere agaghị eji 'nọrọ n'ụlo' mee ncheta maka Biafra nke afo a,"Dịka ndị otu Ipob na-agbalị ịchịkọta ndị bị n'ọwụwa anyanwụ ka ha nọrọ n'ụlọ dịka etu ha si eme ncheta ndị nwụrụ n'agha Biafra, nke afọ a agaghị eme.","Onye okaikpe Mazi Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako gwara BBcIgbo na mkparịta ụka na emume ị nọ n'ụlọ nke afọ a agaghị eme maka ọrịa coronavirus. Ejimako kwuru sị "" Onye m na-anọchite bụ Nnamdi Kanu mara nke ọma na ọ bụrụ na ha chọrọ ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlo na ha ga-anọ kama ọ bụ maka etu coronavirus si awakpo akụnụba ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ mere ka a hapụ ihiwe ya"". O kwukwara na nnamdi Kanu si ka ejiri oge a buo ọnụ ma tụgharịa uche maka ya bụ ụbọchị. Microsoft sị ọ bụ rọbọt ga na-edeziri ha akụkọ Ndị ọrụ Microsoft e kwuola na ha ga-achu ndị ọrụ ngo ntaakụkọ ha n'ọrụ were nke Bekee kpọrọ rọbọt dochie ha. Nke a pụtara na ihe dịka mmadụ iri ise ndị ọrụ ngọ na-arụ na MSN ha ga-agba aka ọrụ na Juun mgbe ha bụ amụma ga-amalite. Mana ha sịkwa na ọbụghị coronavirus mere ha jiri kwuo ya, kama ọ bụ ihe nchọpụta ha na-eme kwamgbe gosiri. Idemmiri na Kenya N'Afrịka, idemmiri egbuola mmadị narị atọ ma chụpụkwa ezinaụlọ karịrị puku narị asatọ na be ha na Kenya . Ọnọdụ a mere ka agha ha na-ebusa igurube na nje coronavirus bụrụ ihe nara azụ n'obodo Kihoto dị nso na Nairobi. Bayern Munich egbuola Fortuna Busssedorf Na Bundusliga taa, Bayern Munich enwerela ọkpụ ise asataghị ihe nyụọ ndị Fortuna Busssedorf Ịkpakwụ. Robert Lewandoski nyere goolu abụọ n'ime ise ahụ. Ndị omekome atọhapụla onyeisi ndị CAN na Nasarawa steeti Ihe ọṅụ emeela na Nasarawa steeti dịka ndị ntọ tọhapụrụ onyeisi ndị Christian Association of Nigeria na ebe ahụ. Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bola Longe kwuru na Joseph Masin e ji kemgbe izuụka abụọ enwere onwe ya kemgbe abalị satọde." afirika-43969466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43969466,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Awakpola onye ogbu opi na Ethiopia,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Gọọmentị Naịjirịa machiri ị tụbata Codeine taa.,Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike enyela iwu ka NAFDAC bụ ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naijiria machie inye ikike ịtụbata codeine na Naijiria maka ime ọgwụ ụkwara. Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Ịsaac Adewole meere ka amata nkea n'ụlọọrụ n'abụja n'ụbọchị Tuusde. N'ebe ọzọ... Akụkọ na-eru anyi nti na akọwa na ihe ruru mmadụ iri abụọ n'aọ anwụọla na obodo Mubi dị na Adamawa steeti ebe ogbunigwe abụọ gbara ebe ahụ. Anya hụrụ ya na-akọwa na ọ gbara ka ndị ụka alakụba na-akwado ị ga ekpere nke ehihie. Na Legos Ụfọdụ mmadụ emerụọla ahụ na Legos ebe emume iji cheta ụbọchị ndị ọrụ ghọrọ ọgbaghara. Ndi otu ngalaba n'achịkọta ndị ọrụ ụgbọala bụ NURTW n'aha ịchafụ bụ ndị a tụrụ aka n'aha bidoro nsogbu a. N'egwuregwu Otu bọọlụ Welwalo adigrat na mba Ethiopia awakpoola onye ogbu opi na asọmpị ha na-agba. Ọ bụ ekweteghị n'ihe ogbu opi ahụ kwuru kpatara nke a ebe ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'ala ha chụrụ ha na ndị nkuzi ha n'ọrụ n'ike. Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma: BBC Igbo gara emume a na-akpọ GTFood and Drink fair na Legos taa. Lee ụfọdụ foto anyị sere ebe ahụ: Gee nkeji nke mgbede a ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Ofalla ala Igbo 42941646,https://www.bbc.com/igbo/42941646,Eji uteọrịa bute Oliseh Metuh n'ụlọikpe,"Eji uteọrịa buru Oliseh Metuh, onye bụbụ onye na-ekwuchitere pati na-achịbụ Naijirịa bụ PDP, gaa ụlọikpe ukwu na Abuja taa.","Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ. Ụlọikpe ukwu a nke a na-akpọ Federal High Court n'asụsụ bekee bụ ebe Metuh na-aza aziza banyere ihe ọ ma maka mpụ na aghụghọ mere mgbe PDP na-achị Naịjirịa. Onye ọkaiwu na-anọchite Metuh gwara onye ọkaikpe mgbe ikpeazụ okwu ya putara na ọ [Metuh] nọ n'ụlọọgwụ ọpụrụiche Nnamdi Azikiwe na-anata ọgwụ maka ihe mere ya n'ọkpụkpụazụ. Onyeachi Ikpeazu, bụ onye na-edu ndị okaiwu Metuh, kwuru mgbe ahụ ka-adọtikwuo mgbe a ga-ekwu okwu Metuh na ụlọikpe aka, inye ya ohere ka ọ gaa ụlọọgwụ. Ha gosikwara akwụkwọ onye dọkịta dere maka Metuh. Onye ọkaikpe ekweghị, ma sịkwa na ha ga-anabata arịrịọ ndị wetere okwu rịọrọ ka-anapụ Metuh ntụhapụ enyere ya ma ọ bụrụ na ọ biaghị ụlọikpe taa. Mana, ka ọkaikpe hụrụ Metuh n'ime uteọrịa, ọ dọtịrị ikpe a aka. Ha ga-alagachị ụlọikpe n'ụbọchị 15 n'onwa Mach n'afọ a. Ọkaikpe kwuru sị: ""A hụrụ m ọnọdụ Metuh. Maka ya, echem ka m dọtịa oge a ga-ekwu okwu a ka onwee ike nwete onwe ya, bịa zara ọnụ ya."" Ndị nchekwa nọchiri uteọrịa Metuh, ma gbochie ndị ntaakụkọ chọrọ ise ya foto, mana ọrụ nta akụkọ Punch setere otu ọfụma." media-47759638,https://www.bbc.com/igbo/media-47759638,Adams Oshiomhole: Ihe isii o kwuru maka nkwekọrịta APC na AAC na ntuliaka 2019,Otu APC agọọla na akụkọ na-ekwu onyeisioche pati ha bụ Adams Oshiomhole agọnahụla mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi n'okwu gbasara nkwekọrịta APC na AAC na Rivas steeti bụ akụkọ ndị afọ njọ.,"Adams Oshiomhole agọnahụla Amaechi n'okwu nkwekọrịta APC na AAC APC kwuru n'akwụkwọ ozi ha wepụtara nke Lanre Issa-Onilu bụ odeakwụkwọ mgbasaozi binyere aka na Oshiomhole na Amaechi dị na mma. ""Ihe Onyeisioche kwuru bụ na o nweghị nkwekọrịta e dere n'akwụkwọ ha na AAc nwere mana nke a apụtaghị na o nweghị nkwekọrịta ọbụla APC nke steeti nwere."" Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole kwuburu mkparịtaụka ya n'ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere na nsonso a na o nweghị mgbe otu ahụ na otu pati AAC ji nwee nkwekọrịta ịkwado onye ọbụla na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Rivas steeti. ""O nwebeghị ebe m kwuru na anyị (APC ) na otu ọbụla nwere nkwekọrịta."" O kwuru nke a n'agbanyeghị na Rotimi Amaechi na ndị APC Rivas steeti dọnyere Awara Biokpomabo nke AAC ukwu na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas na nso nso. ""O nweghị onye sị na pati anyị ya na ndị isi ọrụ APC n'etiti gbara ụka maka nkwekọrịta ọbụla."" Lee okwu isii Oshiomhole kwuru na-akpọtụ akpọtụ 1. ""Inec akwụbaghị aka ọtọ na ntuliaka 2019."" 2. ""Inec kagburu ntuliaka ndị ejighị 'card-reader mee n'ebe ụfọdụ ma hapụ ịkagbu ya n'ebe ndị ọzọ."" 3. ""Ntuliaka 2019 e mere kwụ ọtọ, na enweghị mkpagbu ọbụla."" 4. ""Akpamaoke Inec megidere APC doro ewu na ọkụkọ anya."" 5. ""Steeti ndị anyị meriri doro anya, ha wereya nye pati ọzọ."" 6. ""Ndị ọrụ nchekwa rụrụ ndị nyere ha ego ọrụ."" Akukọ ga-amasị gị:" afirika-46114554,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46114554,Social media: Chee ya echee tupu ị mee ihe isii a,Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ ji aka ha kotere onwe ha okwu site n'ụdịrị ihe ha tinyere na soshal midia ha.,"Tupu ị mara ụdịrị nsogbu ị dabara n'ime ya maọbụ ịchọta etu ị ga-esi apụta na ya, ọ banyela n'ihe ịta ikikere eze. Mana BBC chọrọ inyere gị aka makana Igbo kwuru sị na ""agha e yiri eyi anaghị eri nwa ngwọrọ"". Ihe ị ga-agbara ọsọ na soshal midia Enweghị ihe ọzọ ị ma maka soshal midia, mara na ọ naghị echefu ihe echefu. Enweghi ihe banyere na ya mmadụ agaghị achọtanwu, n'agbanyeghi afọ ole ọ ga-ewe. 1) Esela onwe gị ebe ị gba ọtọ: Ọhụrụ ọhụrụ a, ọdịghị ka e nweela ihe ka etinye ndị mmadụ na nsogbu na soshal midia karịa ihe nkiri maọbụ foto na-egosi ka ha gba ọtọ. Ụfọdụ bụ ndị sere foto maọbụ mee ihe nkiri zigara ndị ha che hụrụ ha n'anya, mana ha tụgharịrị azụ tinye ya ebe ụwa niile ga-ahụ ya. Ndị ọzọ bụ ndị hapụrụ ndị mmadụ ka ha see ha foto, mgbe okwu dagharịrị, ha ekesaa ya iji mee ka ndị mmadụ taa ha ụta. Ya mere, ọ bụrụ na ị segodu onwe gị foto maọbụ mee ihe nkiri, gbaa mbọ hụ na ọ banyeghị na soshal midia (hichaa ya n'ekwentị), ka ọ ghara ịbịa tụọ gị mbọ n'ike n'ọdiniihu. 2) Chee ya eche tupu ị tinye foto ụmụ gị: Ọtụtụ oge ka ị ga-ahụ foto ụmụaka, ma hụkwa ebe ọtụtụ ndị na-ekesa ya ma ọ bụrụ na ha 'mara mma'. Mana ị ma na foto ndị ahụ nwereike itinye ha na nsogbu? Ndị na-atọ mmadụ nwereike isi na foto ị tinyere na soshal midia gị hụwa ihu ụmụ gị ama, chọrọ ha gaa n'ụlọakwụkwọ (ọdịghị mma itinye aha ụlọakwụkwọ ha). Ọbụghịkwa naanị ndị ntọ o, kedụkwanụ maka ndị okokporo na-awakpo ụmụaka? 3) Akara ekwentị gị: Ọ bụrụ na ị bụghị onye ọ dị mkpa iji akara ekwentị ya azụ ahịa, ọ bara uru itinye ya na soshal midia? Ị were akara ekwentị gị (nke na-agbasaghị azụmahịa gị) tinye na soshal midia, ọtụtụ ndị ị ma na ndị ị maghị ga-ebido ịkpọ gị. N'aka ọzọ, ndị na-egwu mmadụ 'chandum' nwereike iji gị gwọrọ abacha. 4) Tulee uche gị tupu ị tinye ebe ị bi: Ekwesịrị ịgwa gị nke a? Ụwa emebiela ugbua nke bụ na ndị omekome nwereike ịchọrọ gị bịa ebe ị bi site n'ihe ha chọpụtara n'aka gị site na soshal midia gị. N'otu aka ahụ, soshal midia gị sị gị kwuo ebe ị nọ, nke bụ 'check in' na Bekee, gbachị ya nkịtị. Makana ide ebe ị nọ nke bụ 'location' na Bekee, nwereike ibutere gị otu nsogbu n'ime abụọ a: 5) Taa okwu ata tupu ị kwuo ya: Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ezutela di maọbụ nwunye ha nakwa ezigbo enyi ha n'elu soshal midia, mana ụfọdụ ezutekwala ọnwụ ha otu ebe ahụ. Ya mere, chee okwu gị echee tupu ị gwa onye ị na-amaghị okwu na soshal midia. Kedụ uru ọ ga-abara gị ịkọrọ onye ị na-amaghị ihe dị omimi gbasara gị? 6) Ọrụ gị: Ị bụrụ onye na-arụ ọrụ Bekee maọbụ na ị na-efe mmadụ n'ụzọ ọbụla, tulee echiche obi gị tupu ị tụpụta ya. Soshal midia na-enyezị ndị mmadụ ọrụ ugbua, mana ọ na-anapụkwa ndị mmadụ ọrụ. Ọhụrụ ọhụrụ a, ụfọdụ ụlọọrụ na-enyocha etu onye ha were n'ọrụ maọbụ ha chọrọ iwe n'ọrụ, si akpa agwa na soshal midia. N'otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị bụ onye ọrụ ya adịghịzị enye obiọma, maọbụ na enwere onye na-achọ gị okwu n'ọrụ, gbalịa hụ na ị deghị ihe ọbụla gbasara ya na soshal midia, makana ị maghị ebe ọ ga-agaru nakwa onye ga-ahụ ya. Ị mụtala ihe n'akụkọ a? Ngwa sị BBC Igbo ndeewo. 'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny" mba-uba-50266111,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-50266111,Eke adọgbuola otu nwaanyị woo ya n'olu,A hụrụ otu nwaanyị ka eke ka mmadụ ogo gburu ya ka gbakọ n'olu ya na steeti Indiana dị na mba Amerịka.,"Ụdịrị Eke a si Ndịda Asia mana ndị mmadu na edowe ha n'ụlọ ebe ọzọ (foto ochie) Ndị uweojii hụrụ Laura Hurst dị afọ 36 ka ọnaghị emegharị ahụ mgbe akpọrọ ha ka ha gbata otu ụlọ dị n'obodo Oxford. Agwụ 140 nọ n'ime ụlọ ahụ eche na arụrụ maka idosa ha mgbe ndị uweoji ruru ebe ahụ. A na-eche na ihe ruru 20 n'ime agwọ ndị a bu nke nwa ada Hurst. Onye uweojii si nwe ụlọ a ihe a nọ mee bụ onyeisi ba bụ Don Munson, bụ onye ụlọ ya nọ dị nso. Maazị Munson sị na ọnwụ Hurst bụ na mberede ma kwukwa na ya na-enye aka etu osi kwesi. Onye uweojii aha ya bụ Kim Riley sị na onye hụrụ Hurst n'izizi kopuru eke ahụ n'olu ya mana ndị ọrụ gbata gbata ekwunyitefughi ya. Ọ sị na ya bụ nwaanyị gara ileta agwọ ya mgbe mberede a mere. ""Ọ nwụpụtara ya bụ agwo nwere ya na-eme ihe ndi mmadu ji agwọ eme."" A na-enweta eke na Afrịka, Asịa na Australia (foto ochie) Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" afirika-44857131,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44857131,Osibanjo gara Kastina maka ide mmiri,Oke mmiri nke bidoro n'ime abalị Sọnde ruo nwanne ụnyahụ na okeala Nije na Naịjirịa butere ide mmiri nke tara isi mmadu 52 dịka ndị ọrụ gbatagbata steeti ahụ siri kwuo.,"Ide mmiri a gbachibidoro obodo 15 mgbe akwammiri jikọtara ha gbabiri maka ajọ ide a Akwụkwọ ndị otụ a depụtara na-ekwukwa na ihe ruru mmadụ 20 na-efukwa efu. Akwụkwọ nta akụkọ Guardian na-egosi na ọ ga-ahịaahụ ịmatacha mmadụ ole ihe a metutara maka mgbe ya bụ njinji jiri. Sụpiri sụpiri ya dị na akara a dị n'elu. Mkpa mkpa ya bụ ide mmiri kpara dị egwu nke bu na ọnụọgụ ndị nwụrụ ụbọchị ahụ omere esila 44 gbagoruo 52 ụnyahụ osote onyeisiala, Yemi Osibanjo na Gọvanọ steeti ahụ bụ Bello Masari gara ebe ahụ maka iti ndị ya bụ ihe metutara aka n'obi. Ya bụ ide mmiri kwatukwara ihe ruru ụlọ 500 ma chụpụkwa ihe ruru 5,000 n'ụlọ ha. Ya bụ ọnụọgụ ndị nwụrụ nke a na enyo enyo sitere n'ọnụọgụ ozu mmadụ ahụrụ ebe ahụ. Akụkọ a na-akọwa na ya bụ ide mmiri buuru ọtụtụ mmadụ na ehi ụra na be ha n'abalị ahụ. Gọọmenti ekwela nkwa ịnyere ndị ya bụ ihe a metutere aka. Osote onyeisiala, Yemi Osibanjo, kwuru na gọọmenti etiti, nke steeti ahụ nakwa NEMA ga-etikọta aka nwere nyere ndị ya bụ ihe metutara aka. Osibanjo gwakwara ndị steeti ahụ na nna ya ukwu bụ Onyeisiala Buhari siri ha dere juu na gọọmenti etiti ga-agbatara ha ọso enyem aka ma kwekwa nkwa na ụdị ihe ahụ agaghịzị abịakwute ha ọzo. Ide mmiri metutere ihe ruru obodo iri na Jibia distrikt nke mere mgbe iyi dị na obodo ahụ gbara iji were kwobata n'ime obodo, dịka onyeisi gbata gbata ndị SEMA steeti ahụ bụ Aminu Waziri siri kwuo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-43890258,https://www.bbc.com/igbo/media-43890258,Ụlọomeiwu chọrọ ịmalite ịchụ Buhari n'ọrụ n'ike,"Ndị ụlọomeiwu nke nta malịtere ụka maka ego dị $496,374,470.00 nke onyeisiala Muhammadu Buhari jiri zụta ụgbọelu agha Tucano maka ịlụ ọgụ nchekwa obodo nke na-ada na mpaghara Naịjiria ụfọdụ.","Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari Ihe bulitere okwu a bụ akwụkwọ ozi nke Buhari deere ndị ụlọomeiwu ahụ ebe ọ nọrọ gwa ha na ya ejirila ọkpụrụkpụ ego ahụ gonara ndị mba Amerika ụgbọelu ahụ. Onyeisiala anataghị ikike ndị ụlọomeiwu dịka o kwesịrị. Ya mere Kingsely Chinda nke na-anochite anya ndị Rivas steetị jiri baa mba maka agwa ahụ onyeisiala kpara na ibu ụzọ bulichaa ite n'isi ma bịa gwọwa ajụ. N'okwu Chinda, ""ihe bụ ihe mkparị nye ndị ụlọomeiwụ. Ọ dịzị ka anyị a bụ nkịta na-agbọ ụja na-efụ. Agwa a ezuola ịchụda onyeisiala a n'ọrụ"". Okwu a kpalitere mmụọ ndị omeiwu a nke mere na ọtụtụ n'ime ha kwadoro ya bụ alo. Mgbe onyeisioche ụlọomeiwu nta bụ Yakubu Dogara hụrụ na ebe niile ekporola ọkụ, ọ rịọrịọ ndị otu ya ka ha wedeta obi ala maka na ọ bụ ya ka onyeisiala detara ya bụ akwụkwọ. O kwere nkwa na ya ga-ekwu mgbe a ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu. Mana arịrịọ a emeghị ka obi dajụọ ndị omeiwu, kama ha gara n'ihu ịcheta ọtụtụ mmadụ a napuru ndụ ha n'ike n'ọchịchị a. Aliyu Madaki nke Kano kwadoro ka achụpụ onyeisiala Buhari ngwangwa maka amaghị eme ya. Ọ kpọkuru ndị otu ya ka ha kwado ihe Chinda kwuru. Ọchịchị Muhammadu Buhari jiri nde $462 zụta ụgbọelu agha Tucano Sunday Karimi kwetara na onyeisiala Buharị dara iwu obodo, na e kwesịrị ịta ya ahụhụ dịka iwu kwuru. Onyema Chukwuma bụ osote onyeisi pati kacha nta n´Ụlọomeiwu ahụ tụtara alo ka azaghachie Buhari ya bụ akwụkwọ odere chetara ya maka iwu ọ dara ma gwa ya ka o jikere ịta ahụhụ ya na ya so. Na agbanyeghị nke a, Oker Jev chetara ndị otu ya na e kwesiri itinye anya na ya bụ okwu tupu echewa echiche maka ịchupu onyeisiala. TJ Yusuf nke Kogi steeti dọrọ aka na ntị ka ndị otu ha kwuo eziokwu gbasara ya bụ okwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52619010,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52619010,"Dental health: Ịta ""chewing gum"" ọ dị gị mma n'ahụ?",Kedụ ihe ndị ị nụrụla gbasara ịta chịngọm? Ị nụrụ na ọ na-emebi eze? Ị nụrụ na ọ na-agbaze n'afọ ma ị loo ya?,"Akụkọ a ga-edo gị anya na nke bụ eziokwu na nke bụ asị n'ihe ndị a ị nụrụla, ma kuziere gị ihe ndị ị na-amabughi maka ịta chịngọm. Eziokwu bụ na ịta chịngọm nwere uru ma nwee ọghọm, mana akụkọ a na-eji etinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ ọkachasị mgbe ha ka bụ ụmụaka, bụ ọghọm dị na ya. Otu ajụjụ ndị mmadụ anaghị ajụkarị tupu ha etinye chịngọm n'ọnụ bụ ""gịnị dị n'ime chịngọm a m na-ata?"" Azịza ajụjụ a bụ: ihe e ji arụpụta chịngọm gụnyere polyisobutylene, polyvinyl acetate (latex) bụ nke e ji eme ihe Bekee kpọrọ ""gum base"", glycerine, shuga, corn syrup maọbụ corn starch, sorbitol, ụfọdụ na-enwekwa menthol na-eme ka ọ na-ekpo ekpo, Lecithin, Calcium Carbonate nakwa ihe ọtọbịrị bịrị nke a na-akpọ ""sweeteners"" gụnyere Aspartame na ụmụnne ya. Ndị dịka glycerine anaghị enye usoro mgbari nri nsogbu, ebe a na-anyụpụnwu ndị gụnyere shuga na mịntị na nsị. Mana gum base ahụ bụ nke kacha enye nsogbu makana ọ na-ara ahụ agbaze n'ime ahụ. Gịnị bụ uru dị n'ịta chịngọm? 1) Ọ na-enyere aka ịnyụ nsị: Nnyocha gosiri na ịta chịngọm na-enye aka n'ịnyụ nsị ọ kachasị ndị a wara afọ. Ọ na-eme ka akwara ndị na-enye aka n'ịgbari nri na-emegharị emegharị nke ga-eme ka ịnyụ nsị maọbụ ahụrụ dị mfe. Otu onye ọkacha mara n'ọrịa 'bowel cancer' kwuru na: ""ịta chịngọm dịka iri nri bụ nke na-enye aka imegharị akpa nsị mmadụ."" 2) Ọ nwereike inyere gị aka ịgbado anya ọfụma: Nnyocha ndị mahadum Cardiff mere bụ nke e tinyere British Journal of Psychology gosiri na ịta chịngọm na-enyere aka ịgbado anya ọfụma nke Bekee na-akpọ ""focus"". Nke a dị mma nye ndị uche ha anaghị ara ahụ apụ ma ha na-eme ihe dị ka ịge ntị na nzukọ maọbụ mgbe ha na-arụ ọrụ e ji ụbụrụ arụ. 3) Ọ nwereike inyere ndị chọrọ ịta ahụ aka: Ị na-achọ ịta ahụ? Ndị ọkachamara ekwuola na ịta chịngọm nwereike inyere gị aka, ọkachasị nke enweghi shuga n'ime ya. Kedụ etu o si ebute ịta ahụ a? Ụfọdụ chịngọm na-enweghi shuga na-enwe sorbitol bụ 'sweetener' na-anọchi shuga; nke a na-eme ka afọ saa mmadụ ma ọ baa n'afọ ebe ọ dị ukwu. Oke ọnyụnyụ na-ebutekwanụ gịnị? Ọ na-ebute ịta ahụ. 4) Ọ na-enye aka ịkwụsị ọnụ isi: Ị nụtụla maka menthol? Ọ bụ ihe a na-etinye na chịngọm iji mee ka ọ na-ekpo ekpo. Ọ na-enyekwa aka eme ka ukuru ọnụ gị na-esi isi ọma. 5) Ọ na-enye aka ịkwụsị agbọ. Onye agbọ na-ahụ nwereike itinye chịngọm n'ọnụ iji nyere aka kwụsị ya bụ agbọ. 6) Ọ na-enyere aka ịgbatị agba: Maka ndị ọnụ na-ara ahụ imepe, ịma atụ bụ onye ihe mberede mere ma metụta ọnụ ya; ịta chịngọm na-enyere aka ime ka onye ahụ nwee ike imegharị ọnụ ya. Ịta chịngọm iji megharịa ọnụ ga-enyere aka ime ka ọnụ ahụ mepewe ebe ọ ga-emecha dị mfe. Gịnị bụ ọghọm dị n'ịta chịngọm? 1) O nwere ike ịkpata isi ọwụwa: Ụfọdụ ekwuola na ịta chịngọm ogologo oge na-akpatara ha isi ọwụwa. Nke a na-aka njọ ma ọ bụrụ na ị na-enwe ọrịa ọtawa isi nke Bekee kpọrọ 'migrane'. Ndị ọkachamara na-adọ aka na ntị ka onye nwere 'migrane' gbaara ịta chịngọm ọsọ. 2) Ọ na-enye nsogbu n'eze: Ị nụtụla maka ihe a kpọrọ ""cavity"" na Bekee? Ọ bụ oghere dị n'ime eze mmadụ na-amụbawanye ka ụbọchị na-aga, nke na-egbu eze. ""Cavity"" a na-esokwa ihe ọtọ bịrị bịrị dịka nke na-adị n'ime chịngọm. Shuga a na-ebute ure n'eze nke na-ebute bakteria na-amụbanye wee na-eme ka eze ree. Ọ na-emekwa ka agba fụọ mmadụ ụfụ site n'ịtate ya aka. 3) Ọ na-emepe afọ: Ụfọdụ ndị na-ekwu na ịta chịngọm na-amachi ha afọ, mana ndị ọzọ achọpụtala na ịta chịngọm na-emepe ha afọ, na-eme ka agụụ gụọ ha. Nke bụ na ọ bụrụ na onye ahụ anọghị nso ebe ọ ga-ahụ nri rie, agụụ ga-akpa ya eze. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47569823,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47569823,Rochas Okorocha: O soghi na ndị natara 'certificate of return',Inec mezuru nkwa ya taa site n'igbajo ịnye Rochas Okorocha asambodo mmeri ya makana ha nwetara akụkọ na wakporo onye ụlọọrụ Inec.,"Mana Okoroocha kwuru na Inec enweghị ikike ime nke a. Onụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbaozi soshal midia bụ Ebere Nzewuji kwuru na ha mabeghị ihe ha ga-eme ugbua gbasara ya bụ mkpebi. Mgbe a jụrụ ya ma Okorocha a ga-eje ụlọikpe ? O kwuru na ọ mabeghị. Okorocha asaala Ibeawuchi Onye ọ bụla meriri na ntuliaka na-enweteghị asambodo mmeri nke Inec na-enye agaghị aba n'oche eze ya dịka ọkaiwu Goddy Uwazurike si kọwara BBC. Lekwa ihe nkiri ya ebe a. Na nkọwa ya, asambodo mmeri ga-enye onye ahụ ikike ịbanye ebe o nwetere mmeri ịchị. Uwazuruike kwuru na onye ọbụla merịrị na ntụliaka na-enweteghị asambodo mmeri ya nwereike ịkpọpụ Inec ụlọikpe. Uche Ekwuinife natara ikike mmeri dịka sinetọ ga-anọchite anya ndị Anambara sentralụ. Ike Ekweremadu nwetere asambodo mmeri dịka onye ga-anọchite anya ndị si ọdịda anyanwụ Enugu n'ụlọomeiwu sineti. Kamgbe emechara ntuliaka nke ọkwa sineti, Inec enyela onyeisiala Buhari na osote ya asambodo mmeri ma nyekwa ndị otu ụlọomeiwu ukwu nke ha. Ndị nweterela asambodo mmeri ha Akara twitter @BMB1_Official na-egosi ndị sinetọ meriri n'ugwu. Inec ga-enye ndị otu ụlọomeiwu nta n'elekere abụọ nke ehihie taa bụ Maachi iri na abụọ. Akụkọ ga-amasị gị ịkọ" afirika-54181035,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54181035,"Lee ihe ndị na-akpatara gị afọ mgbu, na ihe ị ga-eme maka ya","Ọtụtụ mgbe ka afọ mgbu dulara ndị mmadụ mmụọ n'ihi na ha chere na ọ bụ naanị ""nwa ntakịrị afọ mgbu"".","Mana ndị ọkachamara ekwuola na afọ mgbu nwere ike ịbụ ihe nrụtụ aka maka nnukwu ọrịa dị n'ahụ mmadụ nke e kwesịrị inyocha ma gwọọ kpamkpam ka onye ahụ nwere onwe ya. Dọkịta Anigbamkpu Obinnaadigo kọwaara BBC ihe o ji dị mkpa ka onye nwere afọ mgbu gbakarịa nkịta ụsa n'ọsọ gaa ụlọọgwụ: Apendicitis N'akụkụ afọ aka nri ka ọrịa appendicitis na-egbu mgbu Ihe mbụ na-egosi ọrịa 'appendicitis' bụ na otubo ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ. Ụfụ a ga-emechaa gbadata n'akụkụ aka nri afọ onye ahụ. Oge ụfọdụ, onye ahụ ga-enwe ahụ ọkụ, maọbụ ịnyụ anyụ, maọbụ ịgbọ agbọ. Ọ bụrụ na ọ gaghị ụlọọgwụ n'oge, ya bụ 'appendix' nwere ike gbawaa n'ime afọ mmadụ. Nke a mee, ọ ga-eme ka abụ jupụta n'ime afọ, oge ahụ ka afọ niile ga-amalite ịfụ onye ahụ ụfụ. Mana ọ bụrụ nwaanyị, njirimara orịa 'ovarian cyst' yitere njirimara 'appendicitis'. Ya kpatara ime nnyocha n'oge ji dị mkpa. Ọnya afọ (Gastric Ulcer) Foto na-egosi etu ọnya afọ (ulcer) si enye mmadụ nsogbu Dkt Anigbamkpu kwuru na ọnya afọ na-emetụtakarị akụkụ ahụ dị n'etiti obi na afọ mmadụ. Bekee na-akpọ akụkụ ahụ a 'epigastric region'. Ihe na-akpata ọnya afọ bụ ""mmiri 'acid' nke na-esi n'afọ apụta iji nye aka gbarie nri mmadụ riri"". Anigbamkpu kwuru sị: ""Mgbu ọnya afọ na-adị ka ịcha ọkụ maọbụ ebe awụnyere ose n'ime ọnya."" Ihe na-eme o ji aka njọ gụnyere nri ose, ihe e ghere eghe, erighị nri n'oge, dịrị gawazie. Naanị ndị ọkachamara n'okwu ahụike ga-ekwu ihe ga-enyere onye nwere ọrịa a aka. Ọrịa Okwute Akịrị (Kidney Stone) Foto na-egosi okwute e si n'akịrị mmadụ wepụta Dịka Dkt Anigbamkp si kwuo, ụfụ 'kidney stone' na-afụru na mkpụrụobi. ""Na mgbadata ngụgụ afọ nke aka nrị maọbụ nke aka ekpe ka ụfụ 'kidney stone' kacha emetụ"". ""Mana ụfụ a ga-emecha dajụụọ, ọ nọkata, ọ bịakwa ọzọ."" Anịgbamkpu kwuru na 'kidney stone' abụghị ọrịa a na-ahụ kwadaa, mana ọ bụrụ na i nwee ụdị ụfụ a na-akụkụ afọ gị, biko gaa mee nnyocha. Nsọ nwaanyị Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-enwekarị afọ mgbu ma ha nọrọ na nsọ. Onweghị ihe ọbụla ndị ọkacha mara chọpụtara na-akpata nke a. Ọ bụ etu chi si kee onye. Mana afọ mgbu a na-akwụsị ma nsọ nwaanyị dị otu a gafechaa. Ihe gbasara afọ ime Nwaanyị dị ime ekwesịghị inwe afọ mgbu ma ọ bụrụ na nsogbu ọbụla adịghị Dkt Anigbamkpu kwuru na afọ ime ekwesịghị igbu nwaanyị mgbu. Mana nke a nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe niile amachaghị kwụrụ. O kwuru sị: ""Ọ bụrụ na nwa anọghị n'ime akpanwa dịka o kwesịrị, ọ ga na-egbu nwaanyị mgbu."" Nke a ka a na-akpọ 'ectopic pregnancy' na Bekee. Ọzọkwa bụ ma nwaanyị dị ime nwee ọrịa aji-enyi maọbụ ogbeke maọbụ akpụ ime afọ nke Bekee kpọrọ 'Fibroid', o nwere ike ibute afọ ịfụ ịfụ. Ndị ọzọ Mmiri adịghị ọcha ga-eme ka mmadụ bute nje na-akpata afọ mgbu Agụụ bụ otu ihe kacha ebute afọ mgbu. Ya mere, tupu ị chọwa ọgwụ afọ mgbu, irikwaala nri? Ọzọkwa bụ ajọ mmiri ọṅụṅụ nwere ike ime ka nje baa mmadụ n'afọ. Bekee na-akpọ ya 'parasites', mana ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọkarị ya 'worm'. Nje ndị a na-akpata ọrịa dị icheiche nke afọ mgbu bụ otu n'ime ha. Mana buru ụzọ gaa ụlọọgwụ ka e mee gị nnyocha ma gwa gị ọgwụ ị ga-aṅụ iji nweta onwe gị. Dkt Anigbamkpu kwukwara na ọ dịghị njọ mmadụ ịṅụ ọgwụ 'worm' ihe dịka ọnwa isii ọbụla, ma ọ bụrụ na onye ahụ bi n'okirikiri ebe mmiri ọṅụṅụ adịghị ọcha. Ihe nkiri ga-amasị gị: Gịnị na-esere ndị Ipob na ndỊ Afara-Ukwu?" afirika-53478130,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53478130,Godswill Akpabio: Gbajabiamila enyela Akpabio abalị abụọ iji kpọpụta aha ndị omeiwu NDDC nyere ọrụ ngo,Onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila enyeela Senetọ Godswill Akpabio iwu ka ọ wepụta aha ndị omeiwu naara NDDC ọrụ ngo.,"Nke a na-eme dịka Akpabio nọrọ n'ihu otu ụlọomeiwu hibere maka inyocha nrụrụaka na NDDC kwuo n'ọtụtụ ọrụ a na-ebo ebubo na e mefuru ego na ya bụ ndị omeiwu ka e nyere ya n'ọrụ ngo. Godswill Akpabio bụbu aka na-achị steeti Akwa Ibom ma bụrụ minista na-ahụ maka Naịja Delta ugbua zara okwu ndị kọmitii ndị omeiwu nta Naịjirịa hibere maka mpụ na nrụrụaka. Ha na-enyo mpụ na nrụrụaka mere n'ụlọọrụ ọ dịmma Naịja Delta Bekee kpọrọ ""Niger Delta Development Commission"" (NDDC) n'ụbọchị Monde bụ nke 20 n'ọnwa Jụlaị 2020. Dịka ya bụ mkparịtaụka malitere n'ọnụdụ ịcha ọkụ nke kpatara onyeisi NDDC bụ Danile Pondie ịchị ume ọkụ ka ojuru ya isi, ọtụtụ mmadụ nwere olieanya na nke Akpabio ga-achịkwa ọkụ n'ọnụ. Akpabio malitere okwu ya site n'ịgwa ndị kọmịtii omeiwu na onye bụbu onyeisi ha wezụgara onwe ya na nyocha a kwesiri ime etu ahụ kemgbe. Ọ sị: ""E be anyị nọ abụghị ebe ekwesiri iyi mmadụ egwu."" Ọ gakwara n'ihu si na dịka enyere ndị bịara bo ya ebubo ihe ruru elekere anọ ikwu okwu, na ọ ga-adị mma ka enyekwuo ya ohere ịzara ọnụ ya banyere ebubo ndị a eboro ya. Mana, tupu ọ gaa n'ihu kwuwe ihe ọchọrọ ikwu, ndị omeiwu doro ya anya na ihe ha na-eme abughị iji kparịa onye ọbụla mana okwu dagharịrị ka ha kwuchere nke a. Akpabio sị na ihe mere ọrụ ya na nzute ya na ndị omeiwu jiri di mkpa bụ na ọ dị ya n'obi ihu na ihe gara na Naịja Delta ọfụma. Ọ sị; ""ka anyị nọ ebe a, eji ụmụakwụkwọ Naịja Delta na-agụ akwụkwọ na ofesi ụgwọ akwụkwọ ha."" 'Emetụghị m ego aka' Akpabio gbadosi ụkwụ n'ala na-ekwu na aka ya adịghị na nrụrụaka ma kwukwa na ha emetụghị ego NDDC aka. Mana, o kwenyere na ya binyere aka n'ikenye ndị ọrụngo ọrụ site n'ogige NDDC. Ọ sị, ""otu ihe m binyere aka metụtara ịzu ụgbọala. Ndị NDDC na-ebute ụgbọala ha ji arụ ọrụ n'ọnụ puku narị naira abụọ kwa ụbọchị. A gbara m mbọ ịkwụsị ya. Ugbua onyeisiala nyere anyị ikike igoro NDDC ụgbọla 90."" Daniel Pondei, onyeisi NDDC dar n'ihu ókú a chara ya na mkparịtaụka a Onweghi onye achụrụ n'ọrụ aka m dị na ya Akpabio sị na ebubo na ya chụrụ ndị mmadụ n'ọrụ abụghị eziokwu. Ọ sị na ọ bụghị ihe niile na-eme na ngalaba ahụ ka ya ma maka ya, ọkachasị ebe o si metụta ịchu ndi mmadu n'ọrụ. Ọ sịkwa na ndị niile na-arụ ọrụ na NDDC nwetere ihe enyemaka banyere coronavirus. ""Ndị ọrụ nọ ezumike nwetere ihe ekere n'atumatụ ""covid relief."" Onweghi oge m si onye ọbula ṅụọ iyi Otu ebubo Joi Nunieh bu onye bụbụ onyeisi NDDC boro Akpabio bụ na ọ sị ya ṅụọ iyi na ọ ga-erubere ya isi. Mana Akpabio si na onweghị oge nke a mere ma nacha. Ọ sị; ""Nzukọ niile anyi na Nunieh nwere bụ maka ọrụ."" Ebubo ọzọ Nunieh boro bụ na Akpabio nwere olileanya ịzọ ọkwa onyeisiala mana ọ sị na nke ahụ abụghi eziokwu: ""Enweghi m olileanaya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa."" Joi Nunieh boro Akpabio ọtụtụ ebubo banyere NDDC A na-ekeri ọrụ NDDC nye ọtụtụ mmadụ Akpabio sị na otu ihe a na-eme na NDDC na enye ohere mpụ bụ ikeri ọrụ nye ya ọtụtụ mmadụ. ""Otu ọrụ, enye ya ọtụtụ ụlọ ọrụ. Nke na-eme ka eke nde naịra 49 ọtụtụ mgbe n'otu ụbọchị."" Akpabio si na a na-eme nke a iji gbanarụ iwu sị na minista ga-ebinyeriri aka tupu emefuo ego gbagotere. ""E were nde 49 nye onye a, e were nye onye nke ọzọ, tupu chi ejie, agbariela ijeri naịra iri abụọ na atọ, bụ ego m kwesiri ibinye aka tupu agbarie."" Okwu o kwuru maka Tunji Ojo Akpabio kwugharịrị okwu okwuru banyere onyeisi ndi omeiwu a na-eme ya nyocha bụ Tunji Ojo. Ọrụ enyere na mpaghara Ore abụghị Tunji Ojo ka enyere ya. A na m eweghachi okwu ahụ. Ya bụrụ na ndị mmadụ ghọtaghị m ihe m kwuru Na ngwụcha Akpabio si na NDDC ga-agbanweriri, ma si na ọ bụ ya mere ya jiri na-enwe ọṅụ na enyere ya ohere ị bụ minista Naịja Delta. Tunji Ojo n'onwe ya wezụgara onwe ya na mkparịtaụka ahụ dịka ọ sị na ọ chọrọ inye onye ọbụla ohere ikwu uche ya na atụghị egwu. Daniel Pondie boro Maazi Ojo ebubo na aka ya dị na nrụrụaka NDDC. Ọ bụ ndị omeiwu kachasị irite uru ọru NDDC na-enye Akpabio kụwara ihe yiri akị oyibo nsụgbe oge o kwuru na ndị omeiwu Naịjirịa so na ndị kakasị irite uru n'ọrụ NDDC na-enye dịka ihe ruru pacenti 60 bụ n'aka ha ka ọ na-aga. ""Anyị nwere akaebe gosiri na ọ bụ ndị omeiwu NAAIJỊRỊA kacha erite uru NDDc site n'inwete ọrụ ngalaba ahụ na-enye."" Ka ogbuwara akị a, ọ bịara dị achọghị ka okwucha ihe ọ chọrọ ikwu dịka otu onye omeiwu si ya wete akaebe. Biko nu, zọọ nụ m Otu nwaanyị sọsọ so ndị omeiwu na-enycha NDDC chara Akpabio ụdịrị ọkụ mere ka ọchọwa onye zọpụta. O tiri mkpu: ""Biko zụọ nu m o, nwanne m nwaanyị chọrọ iri m na ndụ. Ịbịara ebe a imeghari Naịiria anya Otu onye omeiwu chanyekwara Akpabio ọkụ site n'ịgwa ya na o jighi eziokwu bịa. Ọ sị: ""Ihe ị bịara ebe a ime bụ imegharị ndị Naijirịa anya. Ị chọghị ikwu etu aka gị siri banye n'ihe mere, maọbụ kwete na inweghi ikike ime ihe i mere."" Enweghi ike izu ego NDDC makana ọ dị na CBN Dịka ọ na-akọwa na o nweghi ike izu ego NDDC makana ọ bụ n'ụlọ akụ Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ ""Central Bank of Nigeria"" (CBN) ka ego ha dị. ""Ọ dị mfe ịchọpụ ego banyere na ego pụrụ site n'atụmatụ onyeisiala Buahri hibere ka a na-etinye ego gọọọmentị ọbụla na CBN."" Akpabio kwuru nke n'ịza ebubo na o zuru nde naịra 40,0000 n'akpa ego NDDC. Ọ sị: ""Unu mee nyocha, unu ga-ahụ ebe ego a nille bara na ihe eji ya mee."" Ihe ndi ọzọ o kwuru: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45996981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45996981,"Ochanya: ""Ọnwụ ya agaghị abụ na-efu"" - Ndị ngagharị iwe",Ọtụtụ ndị mmadụ mere ngagharị iwe na Legọs maka ọnwụ Elizabeth Ochanya Ogbaje bụ nwata a nwakporo.,"Ọrịa akpọrọ Vesicovaginal fistula (VVF) batara n’ahụ Ochanya ka mgbe di nwa nwanne nna ya bụ Andrew Ogbuja nwakporo ya. Andrew Ogbuja bụ onyeisioche ngalaba ebe a na-amụta oriri na ọṅụṅụ na Mahadum Benue Steeti gwara ụlọikpe na Makurdi ka ha gbahara ya na emume a. Ọbụghị sọọsọ Ogbuja nwakporo Ochanya, ụlọikpe a chọpụtara na nwa Ogbuja bụ Victor Inalegwu Ogbuja so kwa na ndị nwakporo nwata a. Ugbua ndị uweojii na-achọ Andrew Ogbuja na nwa ya bụ Victor makana agbafuru ka mgbe ụlọikpe tọhapụ ha n’usoro akpọrọ ‘bail”. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43673039,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43673039,Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe n'Ondo steeti,Ihe ruru ụmụnwaanyị narị abụọ (200) dị ime mere ngagharị iwe n'isi obodo Akure dị n'Ondo steeti ụnyaahụ.,"Ụmụnwaanyị dị ime achọghị ịkwụ ọtụtụ ụgwọ ndị ụlọọgwụ na-ana ha Iji kwuputa etu o siri jide ha n'olu, ụmụnwaanyị ndị a gara n'Ondo State Specialist Hospital mere ka gọọmentị mata na ha achọghị ịkwụ ụgwọ ọhụrụ a na-asị ha kwụọ. Ha nọchiri ọnụụzọ ụlọọgwụ ahụ ma gbochikwa ndị bịara ịnata ọgwụgwọ ịbata n'ụlọọgwụ. Ụmụnwaanyị a kwuru na ego a na-ana ha pụtara N25,000 maka ịmụ nwa na nkịtị nakwa N50,000 nke ịmụ nwa site n'ịwa afọ, karịrị akarị. Akụkọ ga-amasị gị Ụmụnwaanyị a kwuru na ha na-akwụbu N1,000 iji denye aha ha maka nyocha ahụ tupu a mụọ nwa nke bekee kpọrọ antenatal, mana ugbua ha na-akwụzị N4000. Ha kwukwara na ebidoro ịna ha N500 ọzọ maka oge ọbụla ị bịara nyocha antenatal. Iwe ha bụ na ha anaghị akwụbu ụgwọ iji mụọ nwa karịa N1,000 ahụ oge Olusegun Mimiko nọbu n'ọchịchị, mana ugbua o juru ha anya ụdịrị ego a na-ana ha. Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya" afirika-48421395,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48421395,Michael Okpara University of Agriculture: Mmiri gbagburu ụmụakwụkwọ abụọ na Mahadum anyị,Mmiri agbagbuola ụmụakwụkwọ abụọ Mahadum Michael Okpara University so ndị otu ha ga inwe obi ụtọ n'ụlọ oriri na nkwari.,"Odefa kwuru na a na-eche na ọ bụ oke mmanya butere ọnwụ ụmụaka a Adamma Odefa bụ ọnụ na-ekwuru Mahadum ahụ gwara BBC Igbo na ebugala ozu ụmụakwụkwọ abụọ ahụ n'ụlọọgwụ kamgbe ihe a mechara. O kwuru na otu n'ime ha nọ afọ anọ ya ebe onye nke ọzọ anọọla afọ atọ na Mahadum Michael Okpara University of Agriculture. Odefa kwuru na a na-eche na ọ bụ mmanya na-ebu ụmụaka ahụ mere ha ji danye na mmiri amaghị ama. N'ọnụ ya, "" anyị na-atụ anya na ndị bee ha ga-abia taa iburu ozu ha ma emecha nyocha ihe kpatara mmiri ahụ ji gbagbuo ha."" Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ na steeti ahụ kpụrụ afọ n'ala. Mana anyị ka na-anwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 46578155,https://www.bbc.com/igbo/46578155,'Anyị ga-akwado onyeisiala ga-enye anyị nnwereonwe',Akụkọ dị mkpa: Ndị ọchịchị imeobodo achọghịzị ịnọ n'okpuru gọọmentị steeti,"Otu kpọrọ onwe ha All Former Councillors Forum of Nigeria (AFCFN) ekwuola na onye ọbụla ha ga-akwado maka ọkwa onyeisiala ga-abụ onye ga-ahụ na ọchịchị imeobodo ga-anọrọ onwe ha nke Bekee kpọrọ ""autonomy"", ọkachasị ebe ọ gbasara ọchịchị na akụnaụba obodo. Nke a na-abịa ka otu ndị Association of Local Government Chairmen ga-ebido ọgbakọ ebe ha ga-akpa maka ya bụ nnọrọ onwe n'Abuja n'ụbọchị Toosde na-abịa. Cheta na n'ọnwa Epreelụ 2018, Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki gosiri nkwado o nwere ebe gọọmentị imeobodo ịhapụ ịnọ n'okpuru gọọmentị steeti nọ. End of Twitter post, 1 Na mba ofesi, Ihe ruru mmadụ iri anọ emerụọla ahụ ka nnukwu ọkụ gbapụrụ n'otu ụlọoriri dị n'obodo Sapporo dị na mba Japan. Ndị uweojii obodo ahụ sị na ha amabeghị ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ, mana ha emechiela ebe ahụ maka a na-atụ ụjọ ma a ga-enwe ọkụ ọzọ ga-agbapụ. N'egwuregwu, Onye egwu na-ejikọta otu Stuttgart bụ Christian Gentner, nọ n'iru uju ka ọnwụ kpọrọla nna ya bịara ile ya n'ọgbọ egwuregwu ka ha na Hertha Berlin zutere n'ụbọchị Satọde. Ndị otu Stuttgart kwuru na ha so Gentner na ezinaụlọ ya eru uju ọnwụ nna ha N'aka ọzọ, Otu Chelsea bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Victor Moses na-agba bọọlụ, ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Brighton bụ ebe Leon Balogun na-agba. Ebe otu Southampton ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Arsenal bụ ebe nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi na-agba, ka ha zutere na Premier League. Mmeri e meriri Arsenal mere ka ""agba agba emeri emeri"" ha ruru egwuregwu 22, bịa n'isi njedebe. Abụbụ ọrụ ndị Parliamentary Staff Association of Nigeria Ndí isi ụlọ ọmeiwu akpọkuola Minista na-ahụ maka okwu ego ka otinye anya na ihe ndị ọrụ PASAN na-ana. Otu ndị ọrụ ụlọọmeiwe kpọrọ onwe ha Parliamentary Staff Association of Nigeria etiela aka n'ala na ha aghaghị ịgba abụbụ ọrụ nke ha kwadoro ibido ụbọchị Mọnde ma gọọmentị akwụghị ha ụkwọ oruoro ha. Onyeisi ndị otu a bụ Musa Bature mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ụbọchị Fraịde sị na nke a bụ abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị nke abalị anọ. Ndị Uweojii akparala ndị a na-eche ka ha abụ omekome Gọọm̀entị Anambra steeti gbara ndị uweojii ume sịte na ịnye ha akụrungwa eji arụ ọrụ Mbọ gọọmentị Anambra steeti na-agba maka nchekwa obodo amalitela ịmịta mkpụrụ dịka aka ndị uweojii kpatara ndị isiekwe ọnwụ a na-eche na ha bụ ndị oji egbe ezu n' Ogidi. Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwụrụ ndị uweojii n'Anambra steeti sị na ha na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ tụpụ ha ejide ha ebe mgbọ merụrụ otu onye n'ime ha ahụ. Maka mgbanwe mbara eluigwe Michal Kurtyka Onyeisila mba Poland ka ọ na-aṅụrị mgbe etinyezuru aka n'akwụkwọ Liverpool na Man U ga-akwata na mgbede taa Jurgen Klopp onye nkuzi ndị Liverpool N'egwuruegwu, Jurgen Klopp nke Liverpool chọrọ ka ndị otu ya were iwe na ọnụma mgbe ha na Manchester United ga-akwata na mgbede Sọnde. Liverpool ga-anaghara Man City ọnọdụ nke mbụ na lig ma ọ bụrụ na ha emerie ya bụ asọmpi. Gee akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47728761,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47728761,Oge Okoye: Ihe mere mgbe ọ gara n'ụlọekpere Alph Lukau,Ihe na-ewu ewu ugbua bụ na Oge Okoye ome ihe onyonyo a ma ama na Naịjirịa agaala n'ụlọekpere Alph Lukau.,"Otu onyonyo gosiri ebe ụkọchukwu ahụ na-eburu ya amụma gbasara ndụ ya. N'ime ihe onyonyo na-efegharị, Alph Lukau gwara Oge Okoye na oge eruola ọ ga-eji mapụ ndị ụfodụ na ndụ ya. End of Twitter post, 1 Oge na-ebe akwa mgbe nwoke ahụ na-agwa ya okwu maka ụmụ ya nke mere na ọ malitere ịwunyi elu. Alph Lukau bụ ụkọchukwu Alleluia Ministries International nke dị na mba Sawụt Afrịka. Ụkọchukwu ahụ malitere ịwu mgbe ndị ụlọozu na mba Sawụt Afrịka kwuru na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe maka aghụghọ. Ụfọdụ ndị mmadụ dịka ladyveev na-ajụ ihe Oge Okoye gara ebe ahụ ịme Ebe ndị ọzọ dịka Director Flo na-ajụ ma Okoye a chọrọ ịmegharị aka ọrụ ya." afirika-52783327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52783327,Hope Uzodinma akagbuola atụmatụ ịkwụ ndi chiburu Imo steetị ụgwọ ezumike nka,Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma akagbuola atụmatụ ịkwụ ndị chịbụrụ steeti ahu dịka gọvanọ ụgwọ ezumike nka.,"Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu gwara BBC Igbo na o mere nke a makana ịkwụ ndị chịbụru steeti ụgwọ ezumike pụtara ịkwu ha ụgwọ ugboro abụọ. Ọ sị: ""Chetakwa na iwu Naịjirịa kwuru na tupu mmadụ etozuo ịnata ụgwọ ezumike nka, ọ ga-aru ọrụ ruo afọ iri. Nke a pụtara na ya bụru na ị na-akwụ gọvanọ ndị bịara nọ sọsọ afọ asatọ ụgwọ a, ị mara na ị na-ada iwu Naịjirịa nke 1999."" ""Ọzọ were bụrụ na a na-enye ndị chịbụru steeti ego iti aka n'obi tupu ha arituo."" Maazi Nwachukwu sịkwa na ọtụtụ n'ime ndị a rụru ọrụ Bekee ma naa ezumike nka na-anatakwa ụgwọ ọnwa so ya. Ọ sị na ihe mere atụmatụ a jiri magbuo onwe ya bụ na Hope Uzudinma ma na ihe ga-emetụtakwa ya tupu ọ gaa n'ihu ga mee ya. Ọ bụ n'ụbọchị Fraịdee ka Uzodinma binyere aka n'iwu ndị omeiwu Imo steeti nyere ya banyere ịkwụ ụgwọ ezumike ndị chịbụrụ steeti. Iwu ọhụrụ metụtakwara ọkwa niile gụnyere: osote gọvanọ, ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nakwa osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu. Ọ pụtara na ọ ga-emetụta Achike Udenwa, Ikedi Ohakim, Rochas Okorocha nakwa ndi osote ha. Cheta na ọ bụ n'afọ 2007 ka amalitere atụmatụ ịkwọ ndị chịbụru steeti ụgwọ ezumike nka. Ọtụtụ steeti na Naịjirịa sokwa eme ụdịrị ihe a." afirika-56201281,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56201281,George Obiozor na Ohaneze Ndigbo enweghị ikike ikwuru ndị Igbo maka Biafra - Paul Achalla,Paul Achalla akatọọla okwu George Obiozor bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo kwuru gbasara Biafra.,"Obiozor kwuru na ndị Igbo anaghị achọ isi na Naịjirịa pụọ n'ihi na onweghị ihe na-esere ndị Igbo na Naịjirịa. Mana Paul Achalla, onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye nkwado otu nwereonwe Biafra bụ IPOB kwuru na Obiozor enweghị ikike ikwuchitere ndị Igbo niile ọnụ ha. Paul Achalla kwuru na tupu enwee mkpebi ọbụla gbasara Biafra, ndị Igbo niile ga-ekwekọrịta site na ntuliaka nke a kpọrọ referendum. Gere ihe o kwuru." afirika-48765902,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48765902,Sanusi Lamido Sanusi: Akụnaụba Naijiria na-achọ ndakpọ - Emir Sanusi,"Emir nke Kano bụ Sanusi Lamido etiela mkpu maka ọnọdụ akụnaụba Naijiria, were kwuo na ọ na-achọ ndakpọ","Ọ sị na ọ bụ n'ihi ego gọọmenti na-emefu dịka ego mgbakwụnye mmanụ (fuel subsidy) nakwa ọkụ latrik. Sanusi, rụtụrụ aka na Naijiria na-emefu ihe ruru pasent iri asaa n'ego na-abata n'akpa Naijiria n'ịkwụ ụgwọ e ji eji. Ma kwuo sị na ịga n'ihu gbakwụnye ihe ruru otu tari naira na ụma (N1.5Trillion) a na-akwụ maka na-agbakwụnye na mmanụ na ọkụ latrik(fuel subsidy) kwa afọ, Naijiria nọ na nnukwu nsogbu. Sanusi kwuru nke a n'ọgbakọ nkuzi nke onye na-ejide akpaego gọọmenti etiti(Accountant-General) hiwere na Kano ụbọchị Tuzde. Ọ gara n'ihu dụọ onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ ka o wepụ 'subsidy' na mmanụ agbịdị nakwa ọkụ latrik. ""Ala anyị na-akwado ndakpọ."" Naijiria bụ mba ọnụma na-eto ndị mmadụ afọ n'ezie - Ọkammụta ""Ihe na-eme bụ na gọọmenti etiti na-akwụ ego mgbakwunye na mmanụ, n'ọkụ latrik, ọnụ eji ebi ego gbalite, gọọmenti akwụkwa ya."" ""Ihe kacha njọ bụ na anyị gbaghara itinye ego na agụmakwụkwọ, ọnọdụ ahụike nakwa ihe mmepe obodo na-achụ ịnweta mmanụ ụgbọala n'ọnụ ala."" ""Ọ bụrụ ezie, na Buhari chọrọ ịchụ ụbịam, ya wepụ nsogbu ihe a ga-ebutere ụlọakụ ga, ya wepụ ego mgbakwunye mmanụ."" Ọ gara n'ihu kpọọ Buhari oku ka ọgwa ụmụ Naijiria n'ezie ọnọdụ akụnaụba Naijiria dị ugbua ma gbaa mbọ gbaa ọsọ mmiri tupu ozobe, n'ihi na ""akpa ego Naijiria tọgbọ chakoo ugbua."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44400230,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44400230,Gịnị mere ụmụnwaanyị Afrịka ji eghe ntutu ha eghe?,Otu ihe onye mba ofesi kwuru oge ọ hụrụ ntutu otu nwaanyị mba Naịjirịa bụ na ọ dị ogbo.,"Ntutu ndị Afịrịka etu Chukwu si kee ya na nke e ghere eghe O kwuru nke a maka na ọ dịghị fịrị fịrị ka nke a ha, ntutu ụmụnwaanyị Afịrịka na-esi ike, juo eju, nwee ume ma rịgọọ arịgọ n'ụdị nke ya. Ọ naghị anwụla anwụla etu nke ndị mba dị na Yurop maọbụ Amerịka si adị. Mana ọ dị ka ụmụnwaanyị Afrịka aka hụ ntutu nke ndị ọcha n'anya karịa ụdị nke Chukwu nyere ha. Nke a bụ maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị Afrịka na-eji akụrụngwa dị iche iche a na-akpọ 'Relaxer' na Bekee wee na-ete n'isi ha ka o were gbatịa dị ka nke ndị ọcha. Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla ihe kpatara ha jiri hapụ ọmarịcha ntutu Chukwu nyere ha jiri akụrụngwa kemịkal na-ete na ya. Ha jirichaa kemịkaal ahụ, ha arịgọọ ya ka ọ gbatịa dịka nke ndị ọcha. BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị na-eghe ntutu ha eghe ka ha kwuo ihe kpatara ha ji eme ya, lee ihe ha kwuru; Ihe mere anyị ji eghe ntutu anyị eghe Ihe ha kwuru nwereike inwe isi mana ụmụaanyị amakwa ụdị ihe e ji eme kemicaal ahụ ha na-awụnye n'isi na ihe ọ na-eme n'ahụ ha? Ihe kemikaal 'relaxer' na-ebute Ọ bụ eziokwu na ntutu ndị Afịrịka siri ike ma na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ụzọ iji mee ka ọ dị mfe ivo ka ụmụnwaanyị Afịrịka ghara itinye onwe ha na nsogbu site n'ịghe ntutu ha." afirika-48002015,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48002015,Sri Lanka bombings: Unu emerela ndị aka dị na mwakpo a ebere - Buhari,Onyeisiala Muhammadu Buhari agbarụọla ihu na mwakpo eji ogbunigwe mee n'ụlọụka atọ nakwa ụlọ ndịna anọ dị na mba Sri Lanka taa bụ ụbọchi ụka Easter.,"O kwuru nke a site n'ozi onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasa ozi bụ Garba Shehu nke o wepụtara n'ụbọchị ụka n'Abuja. Buhari kasiri ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ ma kpe ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbaakee ọsọ ọsọ. Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị ọrụ nchekwa ghara ịzọ ndị ọbụla aka ha dị na mwakpo a. Aftermath of deadly Sri Lanka explosions Ihe ruru mmadụ nari abụọ na asaa na asaa anwụọla ka ihe karịrị mmadụ narị anọ merụrụ ahụ n'ime mwakpo eji ogbunigwe mee n'ụlọ ụka nakwa ụlọọriri na mba Sri Lanka. Ụda ogbunigwe anụrụ ruru isi. Ụlọ uka atọ ka edoro na mwakpo a. Ha bụ Kochchikade, Katuwapitiya na Batticaloa. Mwakpo a metụtakwara ụlọ oriri na ezumike atọ di na Colombo bụ Shangri La, Cinnamon Grand na Kingsbury. Mwakpo bịara ka ndị ofufe kraịst na-eme emume Easter Sunday sọ n'oriri kachasị dị omini n'ofufe ha. St Anthony's Shrine dị na Kochchikade so n'ebe edoro na mwakpo a Foto pụtara na Soshal midia gosiri ime otu n'ime ụloụka ndị ogbunigwe gbawara n'ime ya - St Sebastian dị na Katuwapitiya - ebe elu ulọ ahu yasachara ebe ọbara nọ n'ọche. Ndị ntaakụkọ Sri Lanka na-akọwa na ndi ofesi bịara nleta nwereike nọrọ n'ime ndị ihe metụtara. Onwebeghi onye si na aka ya di na mwakpo ndị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44977955,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44977955,"Rọchas: Tụọ aka ndị gbụrụ onyeisi APC Ideatọ, nweta nde N20",Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ gbagburu Ejiagwu bụ aka na-achị otu pati All Peoples Congress (APC) n'okpuru ọchịchị ime obodo Ugwu Ideato nke dị n'Imo steeti n'abalị Tọọsde.,"Mana Okorochaa ekwenla nkwa na gọọmentị ga-agba mbọ ịhụ na a nwụchị ndị kpara mkpamkpa ahụ. N'okwu ya, Okorocha kwuru na etu e siri gbuo nwa amadị ahụ na-ewepụghị ihe ọbụla n'ụgbọala ya gosiri n'ọbịghị ndị ohi dịka etu enweghị ihe gosiri na ya na ha gbara mgba gosiri na ọ bụghị ntọ. Okorocha onye kwuru nke a oge ndị ndorondoro ọchịchị nakwa ndị ndu si mpaghara ideato bịara ịgwa ya ihe mere sịrị: ""Site n'ozi anyị nwetara, o doro anya na obighị ndị ojiegbeezu dịka o nweghị iihe a napụrụ ya maọbụ ihe gosiri na-a chọrọ ịtọrọ ya. Nke abụ gbagbu. ọnụ egbe ole a gbara ya gosiri na ọ bụ mgbagbu."" Ndị obu egbe aga egbuola aka na-achị otu pati All Peoples Congress (APC) n'okpuru ọchịchị ime obodo Ugwu Ideato nke dị n'Imo steeti bụ Sunny Ejiagwu. Ogueri Isiguzo bụ onyeisi APC n'Ugwu Owere gwara BBC Igbo na a gbabụrụ Ejiagwu n'abali ụnyaahụ ka o si nzukọ ala. Isizugo sị na ogbugbu nwaamadị a nwereike metụta ndọrọndọrọ ọchịchị a nọ n'ime ya ugbua. Eji 'Ohaneze' mara Ejiagwu bụ otu n'ime ndị isi APC ahopụtara n'ọchịchị ime obodo 27 e nwere n'Imo steeti na ntuiliaka ime ụlọ nke APC Imo steeti mere n'ụbọchị Monde nke izuụka a. Ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na onyeisi uweojii n'Imo steeti bụ Dasuki Galandanchi, gwara ha na eburula ozu Ejiagwu gawa ụlọozu dị nso ebe ihe a mere. Ọ bụ n'okporoụzọ Akokwa nke Ugwu Ideato ka a kpara arụ a. ""E gburu onyeisi APC nke Ugwu Ideato. A gara m ebe ihe a mere lọta. E burula ozu ya gawa ụlọozu. Anyị amabeghị ndị mere ihe a mana anyị na-eme nyocha. Ọbara ndị aka ha dị ọcha ga-agba ha n'anwụ,"" Galandanchi kwuru. Na soshal midia, onye ahọpụtara ka onye mgbasaozi APC n'Imo ọhụrụ bụ Jones Onwuasoanya dere ozi APC zipụrụ maka ihe mere. Isiguzo gwara BBC Igbo na a gbara Ejiagwu egbe ọtụtụ oge, ma kwuo na ogbugbu a nwereike site n'aka ndọrọrọdọrọ ọchịchị. Cheta na APC n'Imo steeti nọ na nnukwu ọgbaghara kemgbe Gọvanọ Okorocha kwadoro ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-anọchi anya ya ma ọ rituo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 46258576,https://www.bbc.com/igbo/46258576,Nutrition: Ụdị nri i kwesiri inye nwa gị iji gbalahụ ọrịa erighị ezigbo nri,Ozi ndị Ministri na-ahụ maka mkpata na mmefu akụ na ịhazị obodo a kpọrọ Ministry of Budget and National Planning na-ekwu na ihe ruru ụmụaka nde abụọ na ụma na-arịa ọrịa erighi ezigbo nri.,"Onyeisi ndị ụlọọrụa bụ Udoma Udoma kwuputara nke a. Udoma sị na amaghị ihe tinyere ọgaranya na ogbenye n'ọrịa. BBC ji tinye ọnụ na ya bụ okwu ịchọpụta ihe nne na nna kwesiri ịme iji chụpụ ya bụ ọrịa erighi ezigbo nri n'ụlọ ha. Ọtụtụ mgbe ka nne na nna na-enye ụmụ ha nri bekee nke ha kpọrọ ""noodles"" na achịcha bekee nke a kpọrọ ""biscuit' aghara aghara hapụ nri zuru oke ha ga-enye nwa ha. Mkpụrụosisi na akwụkwọnri bụ ezigbo nri kacha mma Onye ọkammụta mahadum National Open University of Nigeria bụ Florence Uchendu kwuru na ""ọ ka mma ịnye ụmụ gị nrị be anyị dịka ji, akwa, akidi, agwa, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nrị na ihe ndị ọzọ karịa inye ha ""noodles"" na achịchịa bekee"". Erighị na-emetuta ma ọgaranya,ma ogbenye Florence sịrị na ""ọrịa erighị ezigbo nri dị na ọgaranya dịkwa n'ogbenye"". Ọ sịkwa na ihe kpatara nke a bụ na nne na nna na-agba mbọ ihu n' ego batara n'ezinaụlọ ha ma hapụ ilebanye anya na nri ụmụ ha na-eri. Nutrition: Oke ibu abụghị na ahụ dị nwa m Nke a mere na o nweghịzị onye nwere ohere ilebe anya n'ezinaụlọ. Ọ sịkwa na mgbe ụfọdụ ndị ọgara ya na-enye ụmụ ha nrị ekwesịghị dịka akwa eghere eghe bụ nke ka enye ha naanị abụba. Ụmụaka dị otụ a nwere ike ibu ibu nke nwere ike ịba ha ahụ ma akpachaghị anya mezịa ka ha rịawa obara mgbeli elụ maọbụ ọrịa shụga mgbe ha kataturu ahụ. Nne na nna ndị nwere ike ịna aṅụrị na ahụ dị nwa ha mgbe ha dị na nwata. Ọ Ụchendụ sị ihe kpatara nke a ""bụ nṅomi anyị na-eṅomị ndị ọcha na-agbanyeghị na anyị na ha abụghị otu."" Ọ sịkwa na na-ezie ""ọ bụghị na nrị ""ome n'elụ"" ndị a ndị njọ, kama na ha abụghị ezigbo nrị nwata ga-eri buru. Ha bụ nrị mgbadoume eji eche ka nrị ghee"". Uchendu dụkwara nne na nna ọdụ ka ha gbaa mbọ wepụte oge siere ụmụ ha ezigbo nri iji nyere ha aka ito ma nweekwa ụbụrụ zuru oke. Akụkọ ga-amasị gị" 45148718,https://www.bbc.com/igbo/45148718,Technovation : Osinbajo ekelela ụmụaka Igbo turula ugo ọkaibe n'asompi technụzụ,Otu a kpọrọ Save-A-Soul nọchitere Naijirịa n'asompi a kpọrọ 'Technovation' aburula ọkaibe n'ụwa niile.,"Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onicha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018 Ụmụada ise a si n'Anambara steeti ji teknụzụ ekwentị a kpọrọ, 'FD Detector,' ha mepụtara iji buso nsogbu ọgwụ adigboroja ọgụ n'ala Naijiria, were turu ugo dịka ọka ibe nke bụ asompi ụmụaka ụmụnwaanyị na-eto eto ndị na-emepụta teknụzụ na mba ụwa. Aha ụmụaka isi na-acha ọkụ bụ; Adaeze Onuigbo, Jessica Osita, Promise Nnalue, Nwabụakụ Ossai, nakwa Vivian Okoye sị Regina Pacies Secondary School, Onicha. Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo ekelela ụmụaka na igwe okwu sị ha na ha gbalịrị. Osinbajo Kelegbara Uchenna Onwuamaegbu-Ugwu bụ onye nchịkọta Edufun Technik STEM Center, onye zulitere ụmụaka ahụ na nkanaụzu maka ịkwado ha. Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-egosi obi ụtọ ha n'ihe a mere. Fadahunsi Sefunmi gosiri ọṅụ na ""ụmụaka ụmụnwaanyị emeriela!"" Ayo kwuru na ha kwesiri ekele Osita Nwegu sịrị ha ndewoo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49220700,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49220700,Enugu-Onitsha expressway: Okporoụzọ akpọchiela kpam kpam n'Amansea,Ndị njem si Awka aga Enugwu nakwa ndị si Enugwu aga Awka atọkịrịla na Amansea kemgbe elekere ise gara aga.,"Ụfọdụ na-ekwu na ụzọ kpọchiri kemgbe abalị Fraide. Ihe kpatara nke a bụ ajọ okporo ụzọ awara awara bụ Enugwu-Onitcha express nke kpatara na ụgbọ ala niile tinyere isi na ya bụ ụzọ ochie. Okporoụzọ ala Igbo Onye nta akụkọ BBC na-agafe ya bụ ụzọ kwuru na ndị njem nọ na ịta nkịkịrị eze ugbua. Ọ bụghị taa ka okwu ụzọ ahụ nakwa nke Enugwu-Ọnịcha bidoro ịfịọ na mpaghara ahụ. Ọtụtụ mmadụ akpọkuola gọọmentị maka ya bụ okporoụzọ Enugwu Ọnịcha. Gọọmentị na-ekwu na ha ebidola ọrụ n'okporoụzọ ahụ mana mgbe BBC Igbo gara ya, sọsọ otu akụkụ ka ha rụrụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45189411,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45189411,2019 Election: Ndị ntorobịa a chọrọ ịzọ ọchịchị n'Ebonyi steeti,Ọtụtụ ndị ntorobịa na Naịjirịa apụtala ịzọ ọchịchị na ngalaba dị icheiche maka iwu gọọmenti etiti binyere nke hazigharịrị afọ ndị nọ n'ọchịchị dị icheiche dị.,BBC Igbo gwara ụmụ Igbo ka ha zite ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịzọ ọchịchị n'afọ 2019 n'elu soshal midia. Lee ndị gwara BBC Igbo na ha chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Ebonyi steeti na ntuliaka 2019. Ụfọdụ ndị ntorobia chọrọ isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị zitere aha ha ka a gbaa ha n'anwụ ka ọha nwee ike mata ha. Ụlọomeiwu ukwu Ezaka Caesar Okwudili dị afọ 38 gụrụ 'Banking and Finance' na mahadum. Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Ebonyi Sentraal n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta Eze Scholar dị afọ 31 bụ ọkaiwu. Ọ bụ onye Afikpo chọrọ ịnọchite anya ndị Afikpo Nọt/Sawụtụ n'ụlọomeiwu nta. Ụlọomeiwu nke steeti 1. Chukwuorji Igodo dị afọ 31 bụ ọkaiwu. Ọ bụ onye Ivo chọrọ ịnọchite anya ndị Ivo n'ụlọomeiwu nke steeti 2. Agwu Chijioke Agwu dị afọ 31 bụ onye ntaakụkọ. Ọ bụ onye Amagu Anike Ọnịcha chọrọ ịnọchite anya ndị Ọnịcha Westị n'ụlọomeiwu nke steeti. 3. Omenka John Michael dị afọ 28 bụ onye achụmntaego. Ọ bụ onye Ohaozara chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nke steeti. N'afọ 2018 a ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka ndị ntorobịa Naịjirịa nwee ohere ịzọ ọkwa ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị afirika-49868998,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49868998,Stanley Nwabia: Ihe na-ewute ndị mmadụ maka ọnwụ nwoke a,"Stanley Nwabia, onye a ma ama n'elu Twitter anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri anọ na atọ.","Nwabia na-ejikarị akara Twitter ya akwado otu PDP Ndị ezinụlọ ya kwuru na ọ nwụrụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị ụka bụ 29 Sepụtemba mgbe usoro e ji etinye ọbara n'ahụ ya agaghị nke ọma dịka ụlọọrụ mgbasa ozi 'Premium Times' si depụta. Ụfọdụ ndị enyi ya ekwupụtala na Twitter maka ọnwụ ya ma na-eto ya etu o si bụrụ ọnụ na-ekwusike maka etu ndọrọndọrọ ọchịchị si aga na Naịjirịa. Ihe ndị eji mara Stanley Nwabia mgbe ọ dị ndụ Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na Twitter maka ọnwụ ya Onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa , Atiku Abubakar kwuru na o na-ekele Nwabia maka etu o si kwado pati PDP mgbe ọ dị ndụ. @gentleojay na-ekwu na ọ bụ ọrịa gburu nwa amadi a @TosinOlugbenga kwuru onye amamihe nke ukwuu anwụọla. @UchePOkoye na-eto Nwabia maka etu o si ewepụ ụjọ ma kwuo ihe kwesiri ka ekwuo. @MrOdanz kwuru na ọnwụ Nwabia gbawara ya obi. Akụkọ ndị ga-amasị gị" 46697479,https://www.bbc.com/igbo/46697479,New Years Day 2019: Etu Ị ga-esi mee ka afọ ọhụrụ baara gị uru,"Oge ụfọdụ, ọtutụ mmadụ na-enwekarị mgbagwoju anya gbasara etu ha ga-esi mee ka afọ ọhụrụ ha mawanyekwuo mma karịa ka ọ dị n'afọ ndị gara aga.","N'ịme nke a, ụfọdụ n'ime ha na-adaba n'ọtụtụ ihe ize ndụ dị iche iche, bụkwazị nke na-emecha wetara ha ihe mkpọbi ụkwụ ebe ha na-eme ka afọ ọhurụ ha bụrụ nke mara ezigbote mma. Lee ihe anọ Ị ga-eme ka afọ ọhụrụ a bakwuoro gị uru dịka ọka okwu n'a kpalite mmụọ ndị mmadụ bụ Linus Okorie si tụpụta: 1) Detuo ihe ndị gbara gị n'uche n'akwụkwọ: Ọtụtụ oge, ụfọdụ ndị mmadụ na-echefukarị usoro dị mma bụ nke ha chepụtara iji mee ka ha nwee ezi afọ ọhụrụ bụ ịgba. Iji gbanahụ nke a, gbaa mbọ hụ na echiche ọbụla gbara gị n'uche ga-abụ nke Ị ga-edetu n'ihu akwụkwọ. Nke a ga-eme ka Ị nwee ike cheta ha mgbe oge ruru. 2) Tinye ya n'obi gị: Gbaa mbọ hụ na ihe ndị ahụ I deturu n'akwụkwọ ga-abụkwa nke ị ga-etinye n'obi gị. Ọ ga-eme ka ị na-echeta ihe ndị a mgbe niile, ma mekwaa ka Ị na-arụsi ọrụ ike iji mezuo ha. 3) Tinye ya n'aka Chineke: O kwere nghọta na ihe ọbụla e tinyere n'aka Chineke na-abụkarị nke echekwabara nke ọma. N'ihi nke a, ka o ji dị oke mkpa ka echiche gị niile gbasara afọ ọhụrụ bụrụ nke ga-anọ n'aka Chineke. Nke a ga-eme ka o nwee ike chekwaba ya, ma mekwaa ka afọ ọhụrụ a bakwuoro gị ezi uru. 4) Kwụwa aka gị ọtọ: Mmadụ ọbụla kwesịrị ịkwụwa aka ya ọtọ n'ihe ọbụla ọ na-eme. Nke a ga-enye aka wee mee ka ebumnobi Chineke kwadooro ya bụrụ ihe ga-erute ya aka. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-56609974,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-56609974,"Chelsea vs West Brom: E meela Chelsea tụtụrụ fụchaa, gbaa ha ọtọ ka ụwa hụ",Chelsea ji akpa kpojuo goolu afọ n'ihe bụ mmeri mbụ ha na-enweta kemgbe Thomas Tuchel ji bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha.,"Ndị West Brom emereghị ha ebere dịka ha ji goolu ise chara acha asatara naanị abụọ merie ha n'azụ ụlọ ha na Stamford Bridge. Chelsea buru ụzọ ghọrọ agụ mgbe ha nyere otu goolu na nkeji 27 e ji bido bọọlụ, mana West Brom ji iwe gaa ṅụọ akpụrụachịa wee bịa gwepịa ha ka ose a kwọrọ akwọ. Matheus Pereira nyere goolu abụọ n'ime ihe na-erughi nkeji atọ e tinyekwuru tupu e gbuchie ọkara nke mbụ. Callum Robinson mezuru ya atọ na nkeji 63 tupu Mbaye Diagne emezuo ya anọ na nkeji 68. Ka ọ dị ka Chelsea ekuteturu obere ume, Mason Mount nyere otu goolu na nkeji 71 iji tinyetu ndị Chelsea ọchị n'ihu, mana Callum Robinson jikwa iwe hichapụ ọchị ahụ n'otu nkeji a tụkwasịrị na nkeji 90 e ji agbazu bọọlụ. Mara na Chelsea dị mmadụ 10 gbazuo bọọlụ dịka a chụpụrụ Thiago Silva bụ onye egwu azụ ha na nkeji 29. Mara na West Brom na-azọ isi onwe ha n'ogogo 19 na tebulu Premier League, ebe Chelsea ha sụrụ ka akwụ nọ n'ogogo anọ. Naanị ụbọchị anọ ka Chelsea nwere izutetu ike tupu ha-ezute Porto n'asọmpi Champions League." afirika-45930106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45930106,Nnamdi Kanu ka ọ bụ Peter Obi onye ka Ndigbo chọrọ ugbua?,Ọ bụ na Fraide nke ụbọchị 19 n'ọnwa Oktoba ka ihe onyonyo gosiri Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere na Jerusalem malitere ifegharị ebe niile.,"Ụfọdụ mmadụ ekwetaghị na ọ bụ Nnamdi Kanu n'ezie mana ụfọdụ ndị nọ ya nso ndị gụnyere onye ọkwaiwu ya Ifeanyi Ejiofor na Paul Achalla kwuru na ọ bụ ya n'ezie. A na-anụ kepukepu na Nnamdi Kanu ga-ekwu okwu na n'igwe Redio Biafra n'elekere isii nke abalị taa, bụ ebe ọ ga-akọwa ihe mere n'ụlọ ya n'oge ahụ ndị agha wakporo ya. End of Twitter post, 1 Kemgbe ahụ olu ndigbo kewara na soshal midia dịka ha na-ekwu na mpụta ya ga-ebute nsogbu na ntuliaka afọ 2019. Ndị ọzọ jisike aṅụrị na mpụta ya ebe onye ọkwaiwu ya bụ Ejiofor na-ekwu na ndịagha Naịjirịa ga-azara ọnụ ha maka ntọọ atọrọ Kanu Lee ihe ụmụ mmadụ na-ekwu na soshal midia. David Onodu na-agwa ndị mmadụ ha gba mbọ gbado anya maka 2019. Emeka Gift kwuru ka onye ọbụla na-aṅụ ọṅụ na Nnamdi alọtala. Mazi Nwosu kwuru na onye ọbụla hụrụ Kanu dịka onye nzọpụta enweghi uche nke ya. Henry Okafor na-ekwu ka Nnamdi Kanu n'onwe ya kwụnyere Peter Obi. Jackson Ude kwụsiri ike na-ekwu na ọ bụ atụmatụ Buhari ịtọghapụ Nnamdi Kanu dịka ntụlịaka afọ 2019 na-abịa nso. N'ime ihe a niile, anụbeghi olu Nnamdi Kanu ebe ndị nọ ya nso gwara BBC Igbo na Kanu bụ ""oke mmanwụ a ga-akwado mpụta ya n'ọha"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53530740,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53530740,"Enoch Adeboye, CAN na ndị ọzọ chọrọ a gbaara Buratai na ndị isi agha ndị ọzọ ụgbọ nwamkpi","Igbo sị na ebe ọbụla nwata na-ebe akwa na-arụ aka, ma ọ bụrụ na nne ya anọghị ya, nna ya anọrọ ya.","Etu a ka ọ dị ugbua n'ihe banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjịrịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ, otu, ọgbakọ nakwa okpukperechi na-asị na ọ dị njọ. Dịka nchọpụta otu mbaụwa a kpọrọ 'Internations' mere n'afọ 2019, gosiri na Nigeria bụ mba kachasị gbaa ọnyụba na nchekwa dịka pasentị ndị mbịarambịara nbi na ya na anọ n'oke egwu maka ndụ ha. Ọ bụghị naanị ndị ọcha bịara ala Naijiria, ọtụtụ ụmụ Naijiria atụnyela ndụ ha n'aka Boko Haram, ndị ọchịehi, ndị ohi na ndị ntọ n'afọ Ụmụ Naijiria na-ajụ sị ""ọ bụ na ọkpụ isi amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ?"" n'ihi oke ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa dị iche iche. Ọtụtụ n'ime ha na-akpọ oku sị ka a chụọ ndịisi ndị agha na Naịjirịa nke gụnyere ndị agha ala bụ Tukur Buratai; nke ndị agha ụgbọelu bụ Air Marshal Sadique Abubakar; na ndị agha ụgbọmmiri bụ Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas. Ka anyị tụlee ụfọdụ otu ndị na-akpọ oku a na mgbe ga kpọrọ ya. Ndị ụlọomeiwu ukwu (Sinetị) N'ụbọchị 21 nke ọnwa Julaị afọ 2020, ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Sịnetị sị ka ndịisi ndị agha Naịjirịa rituo n'ọkwa ha. Ndị Sịnetọ Ali Ndume malitere atụmatụ a na nzukọ ndị omeiwu sị ọ bụ n'ihi ọnọdụ nchekwa na kawanye njọ na Naịjirịa. Nke a na-abịa dịka a wakporo ma gbuo ọtụtụ ndịagha na Katsina Steetị nakwa kepukepu sị na ọtụtụ ndịagha Naịjịrịa gbara arụkwaghịm n'ọrụ. Sinetọ Francis Fadahunsi kwadoro ihe Ndume kwuru ma sị ka ndịisi agha kpachapụ iche n'ọkwa ha. Mana nzaghachị oku a, ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ịchụ ndịisi agha n'ọrụ dị onyeisiala n'aka. Ha kwukwara na onyeisiala ga-eme ihe o chere ga-adịrị ndị Naịjirịa mma. Ohanaeze Ndigbo Otu jikọtara ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu bụ Ohanaeze Ndigbo kwadoro ihe ndị ụlọomeiwu kwuru sị ka a chụọ ndịisi agha Naịjirịa. Onyeisi ha bụ Nnia Nwodo kwuru nke a n'akwụkwọ ozi Emeka Attamah bụ onye ndụmọdụ ya wepụtara. Ọ jụrụ sị kedụ ihe pụrụiche n'ebe ndịisi agha a nọ nke mere na Onyeisiala Buhari achọghị ịgbanwe ha n'agbanyeghi na oge ịla ezumike nka ha agaala. Ọ sị na nke a akarịa ịchọ ọ dị mma ndị Naịjirịa bụ nke onyeisiala sị na ọ bụ ihe ya chọrọ. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Otu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka 'Peoples Democratic Party (PDP) 'Action Democratic Party' (ADP), n'oge dị ịche iche akpọọla oku sị ka a chụọ ndịisi ndị agha. onyeisioche PDP bụ Uche Secondus nọọrọ n'ụbọchị Fraịde 24 Julaị 2020 sị ka onyeisiala Buhari gbaa arụkwaghịm n'ọrụ n'ihi otu ihe a kpụ n'ọnụ ""Nchekwa"". Secondus kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ọgbakọ ha kpọrọ ""Ọdịda Naịjirịa dịka mpụ, na ọnọdụ nchekwa ọjọo na-elomi ya"" emere n'Abuja. Ọ sị na ọ dịka ike ịtụ asị na ha emeriela iyi ndụ egwu nke ọchịchị APC ji bịa agwụla ha nke mere na ha amaghịzi ihe ọzọ ha ga-eme. N'otu aka ahụ, ụbọchị 8, ọnwa Juun, afọ 2020 mgbe ADP na-eme emume ncheta afọ atọ nke pati ha ka onyeisioche ha bụ Yabagi Sani kpọrọ oku a. Sani sị na Onyeisiala Buhari kwesịrị ige ntị n'oku a nde kwuru nde ndị Naịjirịa na-akpọ sị ka a chụọ ndịisi ndị agha. CAN, Adeboye na ndị ọzọ N'ụbọchị 3 Febụwarị, afọ 2020 ka otu jikọtara ndị ụka kraịst na Naịjirịa bụ CAN n'ịchafụ mere ngagharị ekpere maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Ha mere nke a n'ihi oke ogbugbu na ntọrị a na-eme ndị ụka kraịst ọkachasị na Kaduna nakwa mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ. N'otu aka ahụ onyeisi ụka'Redeemed Christain Church of God' bụ Enoch Adeboye na ndị ụka mekwara ngagharị ekpere a. Ọ bụ eziokwu na ha akpọghị oku ka a chụọ onye ọbụla n'ọrụ mana ihe ha mere gosiri na obi adịghị ha mma n'ihi ndụ ndị otu ha na-ala n'iyi. Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu nchekwa bụ TY Danjuma bụbu minista nchekwa sị na o mepee ọnụ kwuo ihe na-eme na Naịjirịa na o nweghi onye ga-eri ụra ọzọ. Danjuma kwuru nke a na mahadum Ibadan na mgbape akwụkwọ e mere n'ọnwa Disemba afọ 2019. Cheta na egbuola ọtụtụ ndị otu kraịst gụnyere ndị ụkọchukwu na Steetị ndị dịka Kaduna, Benue, Nasarawa, Abuja na ebe ndị ọzọ. Tinyekwara ike ndị Boko Haram na-akpa n'ugwu Awụsa, ndị ọchịehi (herdsmen) n'Ọwụwa-Anyanwụ, ndị ohi (Bandit) na Zamfara dgz. Mgbe APC nke Onyeisiala Buhari n'isi ya banyere were ọchịchị n'afọ 2015, nkwa ha kwere bụ na ha ga-eji otu afọ kpochapụ ndị oyi ndụ egwu na Naịjirịa. Mana dịka afọ ise gacharala, ọ dị ka a ga-asị na ""ihe na-ebe ka na-ebe"" n'ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 52822113,https://www.bbc.com/igbo/52822113,Coronavirus: Kedụ etu ọrụ gị si ghere oghe nye coronavirus?,Ọtụtụ mmadụ alaghachịla n'ọrụ ha n'ọnwa ole na ole gọọmentị machichara ngagharị maka ọrịa coronavirus.,"Mana egwu ka na-atụ ndị mmadụ ma ha onwereike ibute ọrịa a site n'ụlọọrụ ha. Ya mere BBC ji wepụta ihe mkparịtaụka a ga-enyere ndị mmadụ aka ịchọpụta ma ha o nwereike ibute coronavirus n'ụlọọrụ ha dị iche iche. Pịa aka ebe ka ị họọrọ ụdị ọrụ ị na-arụ ma chọpụta ohere dị, nke i nwereike iji bute coronavirus; I kwesịrị inwe tekịnụzụ JavaScript ọgbara ọhụrụ na ịntanet siri ike iji mepee ihe mkparịtaụka a. Kedụ etu ọrụ gị si ghere oghere? Ghere oghe nye ọrịa Nso nye ndị ọzọ Ngọpụrụonwe Ozi banyere 'ohere ibute ọrịa n'ụlọọrụ na etu ndị mmadụ ji nọrọ onwe ha nso' sitere n'ajụjụọnụ a jụrụ ndị ọrụ n'Amerịka tupu ọrịa Covid-19 na atụmatụ mmadụ ịnọpụrụ onwe ya amalite. Ọrụ ndị e depụtara ebe a nwereike ọ bụghị ndị gbapụtara ihe n'ụfọdụ mpaghara n'ụwa." afirika-48646288,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48646288,Rugged Man: Ihe onyonyo na-ewu na soshal midia o gosiri ka awakporo oti egwu a na London?,Oti egwu ama ama bụ Michael Ugochukwu Stephens eji Rugged Man amara tinyere ihe onyonyo n'akara Instangram ya ọ sị na-egosi ka ndị ọ sị bụ ụmụ okoroọbịa anọ na-awakpo ya.,"Rugged Man na-etinyeka ọnụ n'ihe banyere nchekwa na mpụ na nrụrụaka N'ime ihe onyonyo ahụ, ụmụ okoroọbịa ruru anọ na-akụ otu onye ihe ma dọka akwa ya. Ihe a mere n'ụlọ nrị akpọrọ 805 mere n'ọchịchịrị, nke mere BBC Igbo enweghị ike ịsị na ọ bụ Maazị Stephens bụ onye a na-awakpo na ya. End of Instagram post, 1 N'iji mata nke bu eziokwu, BBC Igbo kpọrọ ekwentị Rugged Man nke otu onye nyere aha ya ka Victor zara, were si na akụkọ akpụ n'ọnụ bụ eziokwu. Ọ sị; ""Awakporo Rugged Man n'ezie na Lodon, mana onweghi ihe ọzọ anyị chọrọ ikwu maka ya ugbua. Anyị ga-ewepụta ozi mgbe na-adịe anya."" Agbanyeghị na onye nhazi ya ekwubeghi ka ahụ dị ya ugbua, Rugged Man zipuru ozi ekele nye ndị na-akwado ya n'akara ya ma na-asị na ya dị mma. Na sosal midia, ụtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka okwu Rugged Man kwuru banyere onye oti egwu akpọrọ Naira Marley butere ya mwakpo a. Cheta na Rugged Man tinyere ọnụ n'okwu Naira Marley kwuru maka mpụ Yahoo Yahoo tupu aka ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpara oti egwu ahụ. Naira Marley Naira Marley na onwe ya nọbụ na mkpọrọ mana akụkọ na-ekwu na ọpụtala." afirika-48755380,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48755380,Southwest Governors: 'O zuola bụ na o zuola',Ndị gọvanọ ise nọ na mpaghara ọdịda-anyanwụ ekpebiela na ha ga-awụsa otu pati ha nọ na ya n'akụkụ were chọwa ihe dara mmiri n'okwu nsogbu nchekwa na mpaghara ahụ.,"Ndị gọvanọ ise ndị ahụ gụnyere Rotimi Akeredolu(Ondo) ;Gboyega Oyetola(Osun), Babajide Sanwo-Olu(Lagos), Kayode Fayemi(Ekiti), Seyi Makinde(Oyo) nwere mkpebi ahụ n'ọgbakọ nchekwa ha nwere n'Ibadan ụbọchị Tuzde. Ha kwetara ime nke a dịka ha na-atụ arịrị na iji-egbe-ezu, ntọ na mkpamkpa ndị otu nzuzo karịrị akarị na mpaghara ahụ. Nzuko na-eso akụkọ ntọ nke na-arị ibe ya elu n'ọdịda anyanwụ nke a na-ebo ndị ọchịehi nakwa mkpamkpa ndị omekome ndị ọzọ. Nigeria High Commission London: Anyị ga na-eziteziri ụmụ Naijiria bi Britain 'passport' n'ụlọ Ụlọọrụ nnọchiteanya Naijiria na mba Briten ekwuola na bido n'abali 24 nke ọnwa June afọ 2019, ha ga na-ezitere ndị tinyere akwụkwọ maka ịnata akwụkwọ njirimaraonye, a kpọrọ 'Passport' na Bekee, ya bụ akwụkwọ n'ụlọ. Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a na webụsait ha, gbaziri ndị o metụtara, ka ha gbaa mbọ na-eweta nvulop a kwụrụla ụgwọ ya oge ọbụla ha bịara maka isere photo maka akwụkwọ ahụ. Ha dọrọ aka na nti ka ha na-etinye akwụkwọ maka ịnata akwụkwọ ọhụrụ ọbụladi ọnwa isii tupu ikike akwụkwọ ahụ ezuo. Nke a na-eme izu ole na ole, otu okorobịa a kpọrọ Jeffrey Akpovweta Ewohime kụriri ụgbọala ruru asaa n'ụlọọrụ ahụ n'iwe maka ọ bịara iwere akwụkwọ njirimara ya, e nyeghị ya. Mana ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naijiria bụ Sunday James gwara BBC na izigara ndị mmadụ akwụkwọ njirimara ha abụghị ihe ọhụrụ. ""Anyị na-emebu ya emebu ka ma na ndị mmadụ anaghị emezu ihe a gwara ha mee iji nweta ya n'ụlọ ha."" ""Ihe ndị a bụ: iweta nvulop nke ị kwụrụ ụgwọ a ga-eji zitere gị ozi ma dekwa ebe e kwesịrị izitere gị ya bụ ozi."" Nwoke erefuola nwa mbụ ya dị abali atọ Aka ndị uweojii akparala nwata nwoke aha ya bụ Chukwuma Enemuo onye ji n'ihi akpịrị ego ree nwa mbụ ya ma gwa nwunye ya na nwa ha nwụrụ anwụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra State bụ Haruna Mohammed kwuru na nke a mere na Ozubulu. Mohammed kwuru na Chukwuma gwara nwunye ya na nwa ha nwụrụ anwụ, mana ọ gara ree nwa ahụ nara otu nari puku na iri ise (N150,000). Chukwuma onye gbara afọ iri abụọ na asaa na otu nwoke a kpọrọ Obi Chidiubem bụ ndị kpara nkata wee ree nwa ahụ. Onye zụrụ nwa ahụ bụ nwanyị aha ya bụ Aṅulika Okafor, onye Uruokwe, Ozubulu. Ka ọ dị ugbua, anwuchiela mmadụ atọ nile ahụ tinyere aka na ya bụ arụ ebe ndi uweojii ekughachitekwala nwata ahụ e rere ere. Super Eagles gbara abụbọọrụ maka ụgwọ ha Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles gbara abụbụọrụ nwantịtị oge ụbọchi Tuuze,jụụ ime ọzụzụ maka nkwado asọmpi na-abịa n'ihi a kwụghị ha ụgwọ asọmpị ha gbara agba dịka ha ji otu ọkpụ asataghị ihe merichca ndị Burundi n'asompi AFCOn na-aga n'ihu ugbua. Ọ bụ mgbe onye ndu ha bụ Mikel Obi,bịara rịọ ha , ka jide obi ha ka ha gbanwere obi ha.. Gee akụkọ BBC na Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Agaghị m egbu oge na nhọpụta ndị mịnịsta - Buhari Onyeisiala Buhari ekwusiela ike na ọ gaghị egbu oge n'ihọpụta ndị obi ọchịchị ya nke afọ a dịka a na-atụsi anya ike n'aka ya. N'ozi sị n'ọnụ onye ndụmọdụ ya na mgbasa ozi bụ Femi Adesina kwuru na Buhari agaghị egbu oge dịka o si mee n'afọ 2015. N'okwu ya ""Oge ole ka ndị Naịjirịa ga-eche tupu onyeisiala ahọpụta ndị obi ọchịchị ya? Ndị Naịjirịa agaghị etinyekwu otu ụbọchị n'iche tupu ha enwe ndị ime obi ọchịchị. Onyeisiala n'onwe ya ekwuola na usoro a agaghị egbu oge dịka ọ dị n'afọ 2015, n'ihi na ọnọdụ agbanweela."" Unu gbadoo anya maka akụkọ nchekwa ụgha - Osinbajo Osote onyeisiala Naịjirịa Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agwala ụmụ Naịjirịa bi n'ofesi ka ha kpachara anya n'akụkọ banyere nchekwa na Naịjirịa si na soshal midia apụta. Osinbajo onye kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na New York sị na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-afụnye ọkụ n'akụkọ ntọrị na Naịjira. CBN adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị maka MMM Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa bụ CBN adọọla ọhanaeze aka na ntị na onye ọbụla tinyere ego ya n'ọbaego ọbụla nke ha akwadoghi ga-ebe nwịị mgbe ego ahụ ga-emi ala. Ozi ha a na-abịa dịka a na-anụ kepukepu na otu ụlọọrụ weta ego bịa were ego a kpọrọ MMM amịpụtala isi ọzọ N'egwuregwu Cheta na asọmpi Iko mbaụwa ụmụanwaanyị ka na-aga n'ihu na Fransị, dịka Sweden nọọrọla anyaahụ were otu ọkpu merie Canada Ebe USA ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Spen iji baa n'agba anọ nke ikpeazụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Nkiri A chọrọm ịdị ka Einstein - Ekene Franklin Ezeunala" afirika-44348483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44348483,Akụkọ kachasị n'abalị a: A bụghị m ogbu mmadụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Asịghị m na m gburu n dị mmadụ na PDP - Kalu,"Ihe Kalu kwuru maka PDP Orji ụzọ Kalu onye bụbu Gọvanọ Abia Steeti n'oge gara aga agọrọla aka ya n'akụkọ na-ekwu na o gburu ndị mmadụ mgbe ọ nọ n'otu PDP. Kalu kwuru na ọ bụ nghọtaghe ka ndị mmadụ nwere n'azịza ọ zara n'ihe onyonyo ahụ na-agagharị. Ebola Saraki ebubo mpụ na ohi ma kpọọ ya n'ụlọ ndị uweojii Ndị uweojii akpọla onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo mpụ na ohi karịasịa ohi ezuru n'ụlọakụ dị n'Offa kwara State Ebe ọnụ kwuru Saraki bụ Yusuf Olaniyonu kwuru na ha ga-azaghachị nke a n'oge na-adịghị anya. Akụkọ mba ofesi Ụmụejima kpụkọtara ọnụ anwụọla na Tanzania Na Tanzania, Ụmụejima abụọ kpụkọtara ọnụ akpọrọ Maria na Consolata anwụọla dịka ha gbara afọ iri abụọ n'otu. Ejima abụọ ndịa bụ ndị nwere otu imeju na otu akpaume nwụrụ site n'ọrịa obi. N'egwuregwu, Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr akpọpụtala aha mmadụ iri abụọ na atọ ga-agba asọmpi iko mba ụwa. Ụmụafọ Igbo gbapụtara ihe na ndị a gụnyere Mikel Obi, Kelechi Iheanacho, Alex Iwobi, Ikechukwu Ezenwa na ndị ọzọ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu" egwuregwu-50624156,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50624156,Man United v Aston Villa: Manchester so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ,Ọ dịka ọ bụ otu ekwe na-akụrụ otu Arsenal nakwa ogbo ha ndị Manchester egwu.,"Ọ bụ n'ihi etu ha si jiri ọkpụ goolu abụọ gbaa onye laba onye laba mgbe ha zutere otu Aston Villa. Agba nke mbụ agachaghịrị otu Man Utd ọfụma dịka Grealish nke Aston Villa nyere ọkpụ mbụ na nkeji 11. Man Utd nwara ịchụkwite ha mana ọ rara ha ahụ rue na ngwucha agba nke mbụ mgbe Heaton pịanyere goolu mbụ ha na nkeji 42. Lindelof gbanyere ọkpụ Man Utd abụọ na nkeji 64 mana aṅụrị ha anọteghi aka dịka Mings saghachiri ha ọkpụ ọzọ na nkeji 66. Man Utd malitere ịgba mbọ nakwa ịgbochi Aston Villa ịnye goolu ọzọ mana o nweghi ọkpụ goolu si na ya pụta. Aston Villa ka ritere otu 'point' n'agbanyeghị na ha gbara onwe ha onye laba onye laba. Dịka ụfọdụ otu egwu bọọlụ na-achụ ndị nkuzi ha, anya ndị mmadụ dị zị n'ahụ Ole Gunner Solskjaer ugbua. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49507613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49507613,Nigerian Cybercrime: Ebu i nwereike ikotere onwe gị na soshal midia,A na-asị na mmadụ nwere ikike ikwupụta uche na onweghi ihe ga-eme ya mana ọ bụghị mgbe onye ahụ kwuru nke dị njọọ.,"Ọ bụ eziokwu na soshal Midia enyela ndị mmadụ ohere ị nọ n'ime ụlọ ha dee ihe ọbụla mgbe masịrị ha mana ụfọdụ chefuo na ""onweghi ihe zoro ezo n'okpuru anyanwụ"". Ihe mmadụ dere na soshal midia nwereike ibutere onye ahụ ọdachị dịka ịkwụ ụgwọ nha, ịga mkpọrọ nakwa ọnwụ dgz. N'iji maa atụ, ndị Amerịka jụrụ inye otu nwata akụkwọ Lebanon ikike ịbanye na mba ha maka ihe 'ọjọọ' enyi na dere n'akara Facebook. Iwu ịntanet na Naịjirịa na ntaramahụhụ ha A bịa na Naịjirịa, onwere iwu na-echekwa ihe ọbụla mmadụ na-eme n'ịntanet, ọ bụrụ na ị daa iwu ndị a, ntaram ahụhụ ga-adịrị gị. Nke a mere na onye na-eme ihe ọbụla n'ịntanet marakwa na ""ụkwụ na-aga wara wara, na anya na-ele zam zam na-ahụ ya."" Ihe onye iwu Cyber Crime nwụchịrị gwara BBC Igbo Cyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46460454,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46460454,Female Condoms: Ihe mere ụmụnwaanyị anaghị egbochi ịtụrụ ime,Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nhazi ọmụmụ n'ezinaụlọ na Naịjirịa etiela oke mkpu na ndị mmadụ anaghị eso atụmatụ mgbochi ịtụrụ ime.,"Okpu nnabụenyi na ọgwụ mgbochi ịtụrụ ime N'ọgbakọ ha mere n'Abuja ebe otu onye n'ime kwuru na ọ chọpụtara na pasenti iri asatọ n'ime ụmụagbọghọ na Naịjirịa anaghị aṅụ ọgwụ ndị a. Onye ọkachamara aha ya bụ Dọkịta Nike Jagun gwara BBC Igbo na ụfọdụ ihe na-akpata ụmụnwaanyị anaghị eji ọgwụ mgbochi ime bụ n'ihi nke a; Jagun kwuru na onye ọbụla nwere usoro nke ahụ ya na-anabata ma nwee kwa ndị ahụike tozuru oke ga-enye onye ahụ usoro ịṅụ ọgwụ ndị a. O kwuru na ọ bụghị onye ọrụ ahụike ọbụla nwere amamihe etu esi agbaso usoro ịnụ ọgwụ mgbochi ndị a. Jagun kwuru na ụfọdụ ihe ọghọm dị na ịgbaso usoro ndị a gụnyere nwaanyị ịgba oke ọbara site site n'ihe o ji bụrụ nwaanyị. Ụfọdụ usoro mgbochi itụrụ ime ndị a gbapụtara ihe: BBC Igbo gbara ụfọ ụmụnwaanyị ajụjụ banyere ihe mere ha anaghị aṅụ ọgwụ mgbochi ịtụrụ ime. Otu nwaaghọghọ aha ya bụ Amara kwuru na ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eji ihe mgbochi dịka okpunnabuenyi ebe ndị ọzọ anaghị eji. O kwuru na ha kwenyere na iji okpunnabuenyi na-eme ka ha ghara ịnụ ụtọ mmekọrịta ha na nwoke. O kwukwara na ụfọdụ ndị nke na-agba akwụna anaghị eji okpunnabuenyi n'ihi nnukwu ego ndị nwoke ha na-enwete n'enye ha na ma ha ghara iyi okpunnabuenyi. Okpunabuihe so n'otu ihe eji igbochi ịtụrụ ime nakwa ibute ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị Amara kwuru na nke ọzọ bụ amaghị ihe maọbụ ogbenye nke bụ na ọtụtụ ụmụwaanyị amaghị maka ụzọ mgbochi ime ebe ndị ọzọ na-achọ ka ha nwete ego, ma ha e chefuo iyi okpunnabuenyi. Nwaanyị ọzọ bụ Oriaku Chukwuemeka Kwuru na ọ bụ maka ihe ọghọm dị n'ịṅụ ya bụ ọgwụ mere ndị mmadụ anaghị ekwe aṅụ. Oriaku Chukwuemeka bụ onye lụrụla di kwuru na ọrịara ezigbo ọrịa mgbe ọ ṅụrụ ọgwụ ahụ nke mere oji kwụsị ya ịṅụ ọgwụ ndị a. Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị achọ iyi okpunnabuenyi nakwa ka nwunye maọbụ nwaanyị ha ṅụọ ọgwụ ndị a. Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke" afirika-43809937,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43809937,A nwụchiela sinetọ duru ndị agbero bata n'ụlọ omeiwu taa,Akụkọ na-ekwu na Sinetọ Ovie-Agege bụ sinetọ na-anọchite ndị Delta Sentraal bụ onye duru ndị omekome ahụ we wakpoo ụlọomeiwu sinetị taa we buru ọfọ ha.,"Ndị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti Kọmịtị na-ahụ maka ịdọ ndị sinetọ aka na ntị kwụsịrị sinetọ Ovie ọrụ maka ihe o kwuru gbasara akwụkwọ iwu na-eguzobe ntuliaka. A kwụsịrị ya ọrụ rue ụbọchị ọrụ iri itoolu, ndị mmadụ na-ekwu na nkwụsị n'ọrụ ahụ kpatara o ji wakpoo sineti taa. Ndị ntaakụkọ Nation wepụtara ihe onyonyo gosiri etu e si nwuchie ya n'akara twitter ha. Ha kwuru na ndi uweojii anwụchiela sinetọ Ovie mana onweghi ọfọ a hụụ o ji. Ndị ụlọ omeiwu nta sonyere nọnyere nke ukwuu taa oge o ji nkeji iri atọ na ise gafee elekere iri na otu inọnyere ha maka ọgbataugheie ahụ mere n'ụlọ ahụ taa. Ọgbakọ ụlọ omeiwu abụọ kpebiri ka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris na onyeisi ndị ngalaba nchekwa obodo a na-akpọ Department of State Services na bekee bụ Lawal Daura ka ha chọta ọfọ ahụ tupu otu ụbọchị agafee. Ihe Sineti kwuru Tata bụ Wenezde ka Sinetọ Ovie ọmo-Agege kpọrọ ndị omekaome bu egbe were bata na ụlọomeiwu ukwu bịa maburu osisi ọfọ ndị Seniti. Ndị otu sị na omume a bụ arụ megide obodo Naịjirịa nke nwere ike ịgbachapụ obodo a ọkpa n'ala maka na ihe ha mere megidere otu na-ime ngalaba atọ ji obodo a. Ha sịkwa na-aga ejị iwu megidere ụdị akwaa lebe ya anya. Ha kpọrọ oku ka ndị otu nchekwa niile kee nkwucha ma dịkwa njikere ịnapụta ya bụ osisi ọfọ ma nye ndị gbara agwa ahụ ntaramahuhu dịrị ha. Ha gbaruru ihu kwuo na omume a bụ nkaram anya megide ndị omeiwu. Agbanyeghị, ndị otu a ewerela osisi ọfọ ọzọ were malite orụ n'ụlọomeiwu ahu taa. Akụkọ ga-amasị gị:" 42884029,https://www.bbc.com/igbo/42884029,Ndị ome iwu si na ha ga etinye anya n'ụlọakụ di icheiche,Ndị Sịnetị emela mkpebi inyocha ụlọakụ dị na Naịjirịa maka ụzọ n'ezighi ezi ha ji amịpụ ego ndị ahịa ha tinyere n'ụlọakụ nchekwa.,"CBN kwuru na ha n'atara ụlọakụ ndị ọzọ ọnụ egọ nde naịra abụọ na ọma nke ha mịpụrụ n'ego ndị mmadụ ha chekwara n'oba ego Ndị weputara atụmatụ butara mkpebi a bụ Sịnetọ Magnus Abe na ndị Sinetọ iri abụọ na abụọ ndị ọzọ nke ha kpọrọ ' Mkpa ọ dị inyocha, idozi na imezi nsogbu dịna ụzọ n'ezighi ezi ndị ụlọakụ ukwu CBN jiri elekọta ndị mmadụ ụlọakụ ndị ọzọ mịpụrụ egọ ha n'ụzọ iwu na-akwadoghi'. Ha kwerikọtara na Gọọmenti Etiti ga gbalị kpuchie ikike dịrị ndị ahịa, gbochie akwuzughi ego mmụba na mmịpụ ego ha n'ụzọ n'ezighiezi. Ndị Sịnetị gwara ndị kọmitti na-ahụ maka ụlọakụ, mkpuchi akụ na okwu ego ka ha mme ihe nkwupụta ọha ma kpọọ kwa onyeisi ụlọakụ CBN bụ Godwin Emefiele na ndị ọrụ ya, gunyere ndị ụlọakụ ọzọ oku. Ihe nkwupụta ọha ahụ ga-enwogharị ma mezịe iwu na usoro metutara mkpuchi ndị ahịa ụlọakụ ma gboo nsogbu dị n'ịmịpụ ego ha. Sịnetọ Abe kwuru ""Oruela ọtụtụ afọ ndị ụlọakụ bidoro ikpa agwa ọjọọ ịmịpụ ego ndị mmadụ n'ụzọ n'ezighi ezi nke megidere usoro ndị ụlọakụ ukwu CBN nyere n'iwu"" Ndị Sịnetị mara gbasara akụkọ ụlọakụ CBN wepụtara na ha n'atara ụlọakụ ndị ọzọ ọnụ egọ nde naịra abụọ na ọma nke ha mịpụrụ n'ego ndị ha chekwara n'oba ego. Ha katọrọ agwa ndị ụlọakụ ukwu CBN maka nleda anya mkpesa ndị ahịa ụlọakụ kpesarala gbasara nsogbu a. Akụkọ yiri ibe ya Bitcoin bụ ego ọgbara ọhụrụ a na-ahụ anya Ndị ụlọ omee iwu Sịnetị adọla ụmụ Naịjịrịa akanantị gbasara itinye ego ha n'ego ọgbara ọhụrụ bụ Bitcoin ma gwa ndị ụlọakụ ukwu CBN, ụlọọrụ mgbanwe ego bụ Naịjirịa Stock Exchange, na ndị ụlọọrụ nchekwa ego na akụ dị icheiche ka ha mee ka ndị mmadụ mara aghọm dịna ego ọhụrụ bitcoins. Ha gwara ndị ụlọ ọrụ National Orientation Agency ""gbasa ozi megide ụlọakụ mmụba ego na ntabianya, na ụzọ mmụba ego ndị ọzọ dị icheiche dịna Naịjirịa. Enyere ndị kọmitti Sịnetị na-ahụ maka ụlọakụ, mkpuchi akụ na okwu ego ịzụka abụọ ka ha mee enyocha gbasra uru na eziokwu dịna bitcoins dịka ụzọ azụma ahịa, ma wepụta usoro eji edozi ya. Onye wepụtara atụmatụ a bụ Sịnatọ Benjamin Uwajumaogu kwuru na ụlọakụ ukwu CBN anabataghị bitcoin, ebe ọbụghị ihe a na-ahụ anya ma onweghi ụlọakụ mọọbụ Gọọmentị ọ bụla n'echekwa usoro ya." afirika-51325663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51325663,Week in Review: Ihe ndị mere izu a ji bụrụ atakata agbọọ,Ọtụtụ ihe akụkọ ọjọọ mere n'ọnwa Jenụwarị a nke mere ụfọdụ ndị mmadụ ji ekpe ekpere ka ya bụ ọnwa bịa n'isi njedebe.,"Dịka izu a bụ nke ikpeazụ n'ọnwa Janụwarị afọ 2020, lee akụkọ ụfọdụ mere ka ọnwa a bụrụ kpọkịrịkpọ. Enyinnaya Abaribe Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Abaribe bụ onye na-anọchite anya Abịa-South n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa. Ihe mere aha ya jị daa ụda n'izu a bụ maka na ọ gwara onyeisiala Muhammadu Buhari sị ya rituo n'oche ọchịchị n'ihi na ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naịjirịa. Okwu ya juru ọtụtụ ndị mmadụ afọ, mana ọ tọghị Buhari ọchị chaa chaa. Ọnwụ Kobe Bryant Kobe Bryant na nwa ya Gianna Kobe Bryant bụ nwaafọ Amerịka e ji bọọlụ nkata mara. N'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Janụwarị ka akụkọ pụtara na Bryant anwụọla. Ọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta. Ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna na mmadụ asaa ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ. Ọnwụ Bryant na Gianna gbawara ọtụtụ mmadụ obi. Ịba Lassa Lassa Fever Outbreak:Etu e si lie nwaanyị Lassa Fever gburu O teela ịba Lassa (Lassa Fever) nyewere nsogbu na Naịjirịa. Mana ọ malitekwara ọzọ n'ọnwa Janụwarị afọ a. Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ anwụọla n'Enugwu. Ọtụtụ ndị ọzọ anwụkwaala n'akụkụ Naịjirịa ndị ọzọ. Nje Coronavirus Ọrịa ọjọọ 'Coronavirus' malitere n'obodo 'Wuhan' dị na mba Chaịna. Mana ọ gbasaala ọtụtụ mba ndị ọzọ ugbua nke mere ka onye ukwu na onye nta chịrị obi n'aka. Ọ batabeghị mba Afrịka ugbua, mana otu ahụike mba ụwa bụ WHO agwala onye ọbụla ka ha kee nkwụcha. Ụgwọọnwa NYSC Onyeisi na ndị otu NYSC N'izu a ka gọọmentị etiti kwupụtara na ha etinyela ego n'ụgwọọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna ha a kpọrọ NYSC n'ịchafụ. Ha buliri ụgwọọnwa ahụ site na N19,800 ruo N33,000. A malitere kwụwa ụgwọ ahụ n'uju n'ụbọchị Fraide. Burna Boy Obi lọrọ ọtụtụ mmadụ mmiri dịka ntuurugo 'Grammy Award' kwara Burna Boy. Ọtụtụ tụrụ anya na Burna ga-erite nturugo a, mana nke ahụ emeghị. Onye nwetara nturuugo ahụ bụ Angelique Kidjo onye mba Bene repọblik. Ado Doguwa Ado Doguwa bụ onye omeiwu nta na-anọchi anya mpaghara Doguwa/Tudun Wada dị na Kano steeti. Doguwa kpọrọ ndị nwunye ya anọ gaa ọgbakọ ndị omeiwu n'ụbọchị Wenezdee izu a. O kwuru na ihe o ji mee nke a bụ iji gosi na ọ bụ nwoke siri ike ma n'ụlọ omeiwu ma n'ụlọ ya. O kwukwara na ụmụnwaanyị ahụ nyere ya ụmụ 27. Akụkọ Doguwa ka na-ewu na soshal midia Brexit https://ichef.bbci.co.uk/live-experience/cps/624/cpsprodpb/vivo/live/images/2020/1/31/a09b28cf-896d-4dd6-b573-6370043a9b1a.jpg N'izu a ka mba Briten si n'otu European Union pụọ. Ọpụpụ ha kụụrụ ọnụ n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe maka nchụda Ihedioha" afirika-55908073,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55908073,Weight Loss: I buru oke ibu? Nrị ndị a ga-enyere gị aka,"""Achọrọ m ịta ahụ, achọrọ m ịta ahụ"" bụ ekpere ọtụtụ mmadụ na-ekpe ọkachasị na Naịjirịa ugbua.","Ha na-eme ihe ndị dịka mmega ahụ, ibu ọnụ, ikechi afọ dgz iji hụ na ha tara ahụ ma kwụrụ chịm. Mana ndị ahụ sị na mmega ahụ mebiga ya oke nwere ike igbu mmadụ, ibu ọnụ nwereike igbukwa mmadụ n'otu aka ahụ. Ha kwuru na ụzọ dị ezi mkpa e ji agbanarị oke ibu bụ site n'iri nri ndị kwesịrị, etu kwesịrị nakwa n'ọge kwesịrị. Onye okachamara n'ihe banyere nri bụ Collins Akanno nwee ụlọọrụ diet234 kpọpụtara ụfọdụ nri ndị na-eme ka onye buru ibu taa ahụ. Akanno sị na nri ndị a gụnyere; Mkpụrụosisi Ọ sị njem ịta ahụ amalitebeghi ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị aracha mkpụrụosisi nke ọma. Mkpụrụosisi bụ nri nwere shuga nkịtị nke dị mma karịa shuga arụrụ arụ. Ha na-eme ka afọ juu mmadụ ruo oge dị anya na-enweghi oke kalori. Ọ sị na mkpụrụosisi nwere akụrụngwa vitamin di iche iche na-eme ka mmadụ taa ahụ. Ha gụnyere; Apụl, unere, anyụ mmiri, kukumba, ube bekee, mkpụrụ greepu, oroma, oroma nkịrịsị dgz. Akụkwọ nri Ọ sị na akwụkwọ nrị so n'otu n'ime nri kachasị akpa ike n'ime ka mmadụ taa ahụ n'ihi akụrụngwa ndị ha nwere. Akụrụngwa dịka fiba, vitamin na minaralụ bụ ndị na-enyeaka ịmịkpọsị abụba dị mmadụ n'ahụ. Ụfọdụ akwụkwọ nri ndị a gụnyere; Ụgụ, olugbu, mgbọrọdị, beets, kabeji, ntụrụkpa dgz. Akwa e siri esi Akanno sị na ndị mmadụ chere na akwa na-eme ka mmadụ buo ibu mana eziokwu bụ na ọ na-eme ka mmadụ taa ahụ. Ọ sị na akwa nwere obere kalori ma nwee akụrụngwa ndị ọzọ dị mma n'ahụ. Na ọ bụrụ na i rie otu akwa n'ụtụtụ, na ọ ga-ekechi gị afọ ruo oge dị anya ka ịghara i na-eri oke nri. Agwa (Beans Porridge) Ọ sị na agwa bụ ihe ọzọ jupụtara na 'protein' na-enweghi kalori ma na-emezi kwa ahụ. Ngaji agwa abụọ i riri n'ehihie dị mma ime ga-ahụ mmadụ kụrụ chịm ma belata oke ibu. Nri ndị ọzọ Akanno kpọrọ aha bụ; Nduku dị ụtọ (Sweet Potato) nke nwere obere kalori, nnukwu potassium,vitamin A na Fiba. Nri oat (Oatmeal) bụ nri e ji 'oat' mee nwere fiba ga-ekechi gị afọ ruo ogologo oge ma i rie ya. Kọfị - Otu iko kọfị kwa ụbọchị na-eme ịta ahụ ọkachasị nke na-enweghi 'caffeine' (Decaffeinated). Collins Akanno gara n'ihu nye ndụmọdụ ma kwuo na-agbanyeghi na nri ndị a na-eme ka mmadụ taa ahụ mana ọ dịghị mma ka e ribiga ha oke. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52317855,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52317855,Coronavirus: 'Lockdown' agbanweeela etu ụwa sị atụgharị okirikiri anyanwụ,Ijeri kwuru ijeri mmadụ n'ụwa dum nọ n'ụlọ maka mmachi ngagharị (lockdown) n'ihi ọrịa coronavirus - nke a ebidola ịgbanwe etu ụwa si atụgharị okirikiri anyanwụ.,"Ndị ọkacha mara kwuru na ụwa na-ama jijiji n'ihi ọtụtụ ihe ndị mmadụ na'eme N'ihi mmachi a, njem maka ọrụ maọbụ egwuregwu, n'okporoụzọ maọbụ n'okporo ụgbọoloko belatara, ebe ụlọ mmepụta ngwahịa dị arọ mechiri emechi. N'ezie, ọtụtụ n'ime anyị welatara aka n'ihe anyị na-emebu. Nke a mere ka nnugha ụwa na-enugha belata. Ọ bụ ihe ịtụnanya ịmata n'ụwa anyị a dị arụ karịa tọn tarị ijeri isii (six billion trillion tonnes). Mgbanwe pụrụ iche City streets around the world are empty as people stay indoors due to coronavirus lockdowns Ndị ọkammụta sayensịa na 'Royal Observatory' nke mba Belgium bụ ndị nyopụtara mgbanwe a. Ndị nnyocha chọpụtakwara mgbanwe a n'ebe dị icheiche na gburugburu ụwa. Na Nepal, a hụrụ ya. Otu onye na-arụ ọrụ na 'Paris Institute of Earth Physics' kwuru na mgbadata ntụgharị ụwa ha hụrụ n'isi obodo ahụ kara aka. Otu okwu ahụ ka ndị mere nchọpụta na Cal Tech University dị na mba Amerịka kwuru na ihe ha nyopụtara na Los Angeles gbara ha nnukwu gharịị Ikuku dịzị ọcha karịa, ebe okeosimiri deere jụụ. Nchọpụta gosiri ajọ ikuku Na Naịjirịa, ọtụtụ ụlọụka kpọchiri akpọchi n'oge a 'Nitrogen dioxide' si n'ụgbọala na injini na-enye ọkụ ebelatala. Ndị sayentịsti kwukwara na oke mkpọtụ na-eme n'obodo mepere emepe belatara. N'otu aka ahụkwa, ndị na-enyocha okeosimiri kwukwara na mkpatụ osimiri belatara Mgbanwe a na-abịa, lakwaa Iro niile tọgbọ chakoo Mgbanwe nile abụghị ihe ọhụrụ. Ndị mmadụ na-akpagharị n'ehihie karịa n'abalị nke mere abalị ji ajụ oyi karịa ehihie. Mbelata ntụgharị ụwa na-emekwa n'oge ezumike na mmemme. Mbelata ntụgharị nke mere n'izuụka na ọnwa olemole gara aga yiri nke a na-ahụ oge Ekeresimesi na mba ndị na-ekpe okpukpere Kraistị." egwuregwu-50683675,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50683675,Carlo Ancelotti abụrụla onye nchịkọta nke ise a ga-achụ n'ime otu ọnwa,Ajụjụ dị ọtụtụ ndị n'ọnụ ugbua bụ 'kedụ onye nchịkọta ọzọ oge ya ruru ịkwara pụọ?',"Nke a bụ maka etu Carlo Ancelotti si sonye na ndị a chụrụ achụ dịka Napoli nyere ya ọsọ n'abalị iri nke Disemba 2019, n'agbanyeghi na o meriri n'asọmpi Champions League. Ancelotti ka banyere n'ihe bụ afọ abụọ dịka onye nchịkọta Napoli, tupu a chụọ ya Ọchụchụ Ancelotti chịkwaburu Chelsea bịara n'ihi na o nwetaghị mmeri n'ime egwuregwu itoolu ikpeazụ Napoli gbarala na Serie A. N'otu aka ahụ, ndị mmadụ na-ajụkwa ma Premier League ejizi ụtalị mmụọ apịapụ ndị nchịkọta ha? Gịnị mere ha ji ajụ ajụjụ a? Ọ bụ naanị onye uche ya na-adịghị n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ onye amaghị na a chụọla ndị nchịkọta anọ n'ime otu ọnwa. Tottenham Mauricio Pochettino nọrọ Tottenham afọ ise tupu a chụọ ya Tottenham malitere egwu oke a mgbe ha sepụrụ Mauricio Pochettinho oche n'otele. Na-erughidị awa 24 e ji chụọ ya, a kpọta 'ọgba afa' nke egwuregwu bụ Jose Mourinho, ka ọ bịa gosipụta ike ya. Arsenal Emery chịkọtara Arsenal naanị otu afọ na ọnwa isii tupu e nye ya ọsọ Na-erughi otu izu, a dọrọ Unai Emery dọpụ n'ezi, sị ya kwara ngwongwo ya lawa. Ha họpụtara Fredrik Ljunberg bụ onye gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga, ka ọ bụrụ onye nkuzi nchere oge. Mana agbanyeghị nke a, Arsenal ka na-agbakwa ọnyụpa. Watford Sanchez Flores nọrọ naanị ọnwa atọ tupu a chụpụ ya N'ime otu izu ahụ onye nke Watford bụ Quique Sanchez Flores esorokwa ha n'azụ. Nke Flores bụ na ekweghidị ya tụọ ute rahụ ụra tupu a wụọ ya mmiri oyi a iji kpọte ya n'ụra. Florez nọrọ naanị ọnwa atọ n'ọkwa tupu a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi. Everton A chụrụ Marco Silva n'ụbọchị Tọzde Ugbua Marco Silva esonyekwala na ndị anamachọọrụ. Oteela atụwara anya na ndị Everton ga-enye Silva ọsọ. Mana ọ bụ mmeri Liverpool meriri ha ụbọchị ụka gara aga ka Ọchụchụ eleghi anya n'azụ a emeela ka ndị mmadụ na-ajụzị sị ""Kedụ onye ụtalị mmụọ ga-ada n'azụ ọzọ?"" Ndị ọzọ e nwere ike inye ọsọ Manuel Pellegrini Onye ọzọ ọkụ nọ n'ike ugbua bụ Manuel Pellegrini, onye nkuzi ndị Westham. Pellegrini meriri naanị otu n'ime asọmpi asaa ha gbara n'ọdị nso a. Mmeri ha nwetara bụ n'aka ndị Chelsea n'abalị ikpeazụ nke ọnwa Nọvemba. Daniel Farke Ọzọkwa bụ onye nkuzi ndị Norwich bụ Daniel Farke. Naani otu mmeri ka o nweterela n'ime asọmpi asatọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" afirika-46003492,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46003492,Ekwenyeghi m na m ga-dị ime dịka m gbara afọ 66 - Ajibola,"""Ekweteghi m na adị m ime, mana mgbe igwe skan gosiri ihe na-eme n'ime afọ m, obi juputara m n'ọṅụ""","Ajibola Otubusin lụrụ dị ya bụ Samuel n'ọnwa Disemba afọ 1977 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise. Ihe a bụ akụkọ nwaanyị mụrụ nwa mgbe ọ gbara afọ iri isii na isii dịka o chechara afọ iri anọ. Nwaanyị a bụ Ajibola Otubusin lụrụ dị ya bụ Samuel n'ọnwa Disemba afọ 1977 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise. Dịka ihe egwuregwu Ajibola chere afọ iri anọ na-amụghị nwa ọbụla, ebe ndị ezinaụlọ di ya na ndị ọzọ na-akọ ya ọnụ amụghị nwa. N'okwu ya ""Amaghị m na m ga-eche afọ iri anọ na-amụtaghị nwa"". Samuel bụ dị Ajibola na-eche nwa ha n'ihu Chineke Ajibola gara n'ihu kwuo na ọ gabigara ọrịa dị iche iche mana Chineke gwọrọ ya ọrịa ndị a site n'ekpere nakwa enyemaka di ya. ""Ọ bụ n'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Febuwarị afọ 2018 ka-achọpụtara na-adị m ime, mgbe anyị mechara ihe a na-akpọ ""Artificial Insemination"". ""E ruru n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, m wee mụọ agadaga nwa nwoke site n'ịwa afọ"". ""Ndị niile chịrị m ọchị na-akpọzi m onye Chukwu goziri"". Di na nwunye mụrụ ejima atọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54220659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54220659,Ije Di: Gịnị mere ndị Igbo ji asị ka nwaanyị nwalee alụmdị na nwunye?,Ọtụtụ ndị agba ọhụrụ amaghị na ndị Igbo nwere omenala alụmdi na nwunye nke na-enye nwaanyị ohere ịga nwalee ma ibi n'ụlọ onye chọro ịlụ ya ọ ga-amasịkwa ya.,"Ọ bụ atụmatụ ahụ ka ụfọdụ mpaghara Igbo na-akpọ Ije di. N'ịkọwa ihe Ije Di pụtara, otu okenye n'obodo Nkwe dị n'okpuruọchịchị Awgu, n'Enugwu steeti, aha ya bụ Ichie Fredrick Chukwu sị na Ije Di bụ dịka nwale nwaanyị chọrọ ịlụ di ọhụrụ. Ọ sị na nke a bụ mgbe nwaanyị achọrọ ịlụ ọhụrụ ga-eburu ụzọ gaa n'ụlọ di chọrọ ịlụ ya ka ya na nne na nna ya na ụmụnne ya nọkọọ. Ichie Chukwu sị na nke a bụ ka nwaanyị a chọrọ ịlụ na ezinaụlọ di chọrọ ịlụ ya mata onwe ha ma nwalee me ha a ga-ebinwu. Ọ sị: ""Atụmatụ a na-enyere onye ọbụla aka. Ezinaụlọ nwoke a mata etu nwaanyị ọ chọrọ ịlụ si akpa agwa, nwaanyị a chọrọ ịlụ amatakwa etu ezinaụlọ ahụ si eme."" Ọ sịkwa na isi nwale a bụ ka oke na ngwere mara ma ha a ga-anọkọnwu. Nke a metụtara nghọta Igbo na ọ bụghị otu onye na-alụ nwaanyị. Usoro esi aga Ije Di Ichie Chukwu kọwakwara na tupu nwaanyị agaa Ije Di, ndị be nke nwoke ga-ebu ụzọ gaa na nke nwaanyị jụta ese maọbụ nata akwụkwọ e dere usoro omenala nwoke ga-eji lụọ nwaanyị ahụ. Ọ bụ n'ụbọchị ahụ ka nke nwaanyị ga-esoro ndi be nwoke ahụ laa n'ụlọ ha jee nọrọ otu izu. Uru Ije Di bara Dịka Ichie Chukwu siri kọwaa, uru Ije Di bara gụnyere: Ụbọchị anọ gachaa, nwaanyị ga-alaghachi na be nne na nna ya were kọwara ha etu o siri jee. Ọ bụ n'oge a ka ọ ga-agwa ndị be ha ma ọ chọrọ ịlụ nwata nwoke ahụ ma ọ chọghị. Ndị nke nwoke ga-ajụtakwa nwa ha ma ọ chọrọ ịga n'ihu, ma kwukwa etu ha siri hụ agwa nke nwaanyị n'oge ha na ya nọ. Ya bụrụ na ha kpebiri na agwa nke nwaanyị adịghị ha mma maọbụ na ya achọghị ya na be ha, ndi nke nwoke agaghị abịachị be nke nwaanyị. Ma ya bụrụ na-agwa ya dị ha mma, ha ga-atụ aro, zitere ndị nke nwaanyị ozi ụbọchị ha ga-ebute ihe niile di n'akwụkwọ omenala ha ga-eji bịa lụọ nwaanyị ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49480480,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49480480,Enugu Insecurity: Lee mmadụ ole e gburu maọbụ tọrọ n'Enugwu steeti na nsonso a,O nweburu mgbe a na-elegara Enugwu Steeti anya dịka steeti kacha nwee udo na Naijiria.,"E gburu Fr Paul Offu ma tọrọkwa Igwe Sunday Orji na nwunye ya n'ọnwa Ọgọst a Mana na ọ dịghịzị otu ahụ ugbua n'ihi na ọ dị ka ihe niile gbasara nchekwa na steeti ahụ aghasaala. N'isi ụtụtụ ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ka ndị omekome wakporo otu ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu. Mana ọ bụghị sọ nke ahụ, lee ugboro ole ndị omekome gburula maọbụ tọrọ ndị mmadụ na steeti ahụ: 1. Fada Clement Ugwu Ndị ntọ tọrọ Fada Clement Ugwu na be ya. Ndị ntọ tọọrọ Ụkọchukwu Clement Ugwu n'ụlọ ya n'ọnwa Maachị. Ugwu na-arụ ọrụ n'ụlọụka St Marks Katọlik Church Obinofia Ndiuno, n'okpuru ọchịchị Ezeagu. Akụkọ kọrọ na ndị ntọ ahụ wekọọrọ ego niile dị n'ọba ego ụkọchụkwu ahụ ma mechaa gbuo ya. E mechara ndị uweojii kwuo na aka akparala ndị gburu ụkọchukwu ahụ. 2: Fada Ikechukwu Ilo "" Iwe m bụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulanị wakporo m"" - Rev Ikechukwu Ilo Ndị omekome wakporo Ikechukwu Ilo n'okporo ụzọ sị Nenwe aga n'ime Enugwu. Mana Ilo, onye bụ ụkọchukwu Katọlik n'arụ ọrụ na St Patrick, Nome, kwuru na ọ bụ ndị Fulanị wakporo ya"". Ha gbatara ya ebe, mana ọ nwụghị. E bugara ya n'ụlọọgwụ 'Annunciation' dị n'Emene Enugwu ebe ọ nọ nata ọgwụgwọ. 3: Fada Paul Offu Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gbagburu ụkọchukwu Paul Offu na Tọọzde gara aga Paul Offu bụkwa ụkọchukwu ọzọ na-arụ ọrụ n'Enugwu nke ndị omekome wakporo ma gbuo. Ọ bụkwa ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani gburu Paul Offu na Clement Ugwu, ndị Uweojii sị na ha nọzị ha n'aka Ogbugbu Offu gbawara ndị ụkọchukwu ụka Katọlik nọ n'Enugwu obi. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe Nke a mere ka ha mee ngagharị iwe ma kpọọ oku ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Enugwu kwara laa. Ndị uweojii kwukwara na ha anwụchiela ndị aka ha dị n'ọnwụ ụkọchukwu ahụ. 4. Igwe ndị Agbaogugu na nwunye ya Igwe Sunday Orji na Nwunye ya Ndị ekperima tọọrọ Igwe Sunday Orji, Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu, Enugwu Steeti n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọst. Eze ahụ na nwunye ya nọrọ abalị olemole n'aka ndị ntọ ahụ tupu a tọhapụ ha. 5: Regina Ugwu E gburu Regina Ugwu oge ọ gara ọrụ ugbo ya n'obodo Nchatancha Nike, Enugwu East LGA Enugwu Steeti. Nke a mere n'abalị iri abụọ n'otu nke ọnwa Ọgọst. Ọ bụ mgbe ọ lọtaghị ọrụ n'oge ka ndị mmadụ bidoro chọwa ya. E mechara chọta ozu ya ebe e ji mma wee sụkachaa ya ahụ. Nke a butekwara ngagharịiwe na mpaghara ahụ, mana gọọmentị mechara kwe nkwa na ha ga-ahụ isi ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe nkiri ga-amasi gị: Kidnapping in Nigeria: 'E gburu ndị atọrọ mụ na ha mana Chineke zọrọ m ndụ' Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-43319889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43319889,Ọsọ Nwamba o nyela aka na nchekwa obodo?,Ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọchụehi na ndị ọrụugbo na steeti dị icheiche na Naịjirịa abụrụla ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.,"Ndị agha malitere agha Ọsọ Nwamba n'ọnwa Feburuwari afọ 2018 Ọtụtụ anwụọla site n'ọgbaghara a tụmadụ na Benue, Taraba, Plateau n Enugwu steeti. Ndị mmadụ na-ekwu na gọọmenti etiti anaghị etinye uche n'ihe gbasara ọgbaghara a nke gbugoro ọtụtụ ndị mmadụ. Nke a kpatara gọọmenti eiti jiri nye ndị agha Naịjirịa iwu ma ziga ha na steeti ndị dị n'etiti Naịjirịa ka ha bido agha a kpọrọ ""Ọsọ Nwamba"" iji chụọ ndị na-akpa mkpamkpa ndị ahụ ọsọ ụkwụ eru ala. Mana agbanyeghi na ndị agha nọ n'obodo ndị ahụ, mkpamkpa ka na-akpa ebe ndị ọchịehi ka na-egbu ndị mmadụ ma ọgbaghara ka na aga n'ihu. Otu onye BBC gbara ajụjụọnụ bụ Gideon Nyom bi n'ọkpụrụ ọchịchị Guma na Benue steeti kwuru na ndị agha agbanweghị ọnọdụ ihe na-eme na steeti ahụ. N'okwu ya; ""Otu ihe anyị chọpụtara site n'agha a ndị ọchịehi a na-ebuso anyị bụ na o nwere ebe ha si abịa akpa mkpamkpa ahụ, ha mesịa ya, ha ala."" ""Ọ bụrụ na ndị agha ebibighi ebe ahụ ha si abịa, anyị agaghị enwe udo."" Mana ihe na-agbagoju ndị mmadụ anya bụ na ndị agha na gọọmenti etiti na-ekwu na ha nọ n'elu nsogbu a mana ọ dịka enweghi agamnihu ọbụla. Onye kọmishọna ndị uweojii na Benue bụ Fatai Owoseni kwuru na onweghi ihe ha nwere ike ime ebe ọ bụ na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue steeti mana ndị ọchịehi ka na-ebuso ha agha. N'okwu ya; ""Naanị nwanne unyaa ka e gburu mmadụ iri abụọ na anọ n'Omusu dị n'okpuru ọchịchị Ọkpọkwu dị na steeti Benue."" ""Otu ezinaụlọ gwụrụ agwụ n'ime mmadụ 24 a e gburu gunyere nwa ha a mụrụ ọhụrụ, gịnị ka mmadụ nwere ike i kwu n'udi ihe a?"" Owoseni kọwara na kemgbe ndị agha gara na steeti ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ọchịehi bidoro ị bata na ya. O kwuru na ọ bụ ezie na gọọmenti Benue kwụ ndị agha Naịjirịa na-azụ, ha agaghị ekwu na ndị agha na-akwado ndị ọchịehi mana naanị ihe ha chọrọ bụ ka ogbugbu a kwụsị. Gọọmenti Benue Steeti ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo Omusu, nke dị n'Edumoga dị na gọọmentị obodo Okpokwu nke Steeti ahụ na mgbede Mọnde." afirika-52722909,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52722909,Coronavirus Cure: Coronavirus abụghị ọrịa ọhụrụ - Maurice Iwu,Maurice Iwu bụ ọkammụta n'ihe gbasara ịmepụta ọgwụ nke bekee kpọrọ 'Pharmacist'.,"Ọ bụkwa ya bụ onyeisi kọmiti na-ebuso coronavirus agha n'Imo steeti na BBC Igbo nwere mkparịtaụka. Na mkparịtaụka a, o tinyere ọnụ banyere ọtụtụ isiokwu gbasara ọrịa Covid-19 na ihe ndị ọzọ so ya. Iji maa atụ, o kwuru na enyemaka ndị mmadụ nyere onwe ha n'oge dị etu a tụrụ ya n'anya. O kwuru na nri ndị mmadụ kere ibe ha nakwa enyemaka ndị ọzọ bụ ihe nyere ndị mmadụ aka ịgbochi mfesa ọrịa. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'ịchafụ: Gịnị bụ uche ya gbasara mgbọrọgwụ mba Madagascar nke gọọmentị zụtara? O kwuru na ọ maghị ihe nọ n'ime ọgwụ ahụ ma kpoo oku ka e mee ya nyocha dịka e si etulee nke ya. N'ọnụ ya ""Ndị Madagascar ma ihe ha mere nakwa ihe ha tinyere n'ime ya"" ma kwuo na o nweghi nsogbu maka ọgwụ ahụ. Ọ kọwara na ihe dị mkpa na ihe ọ chọrọ bụ ihe ndị ga-eme ka ọnwụ si n'aka ọrịa belata n'ihi na ọ karịala. N'otu aka ahụ ọ kwadoghi mmepe obodo nke gọọmentị Naịjirịa na-eme nwayọ nwayọ. Ọ kọwara na o kwesighi ka Naịjirịa soro obodo ndị ọzọ mepee ugbua n'ihi na ọrịa coronavirus ka na-arị elu ebe a. Maurice Iwu kwuru na ọrịa coronavirus ga-agbanwe etu ndị mmadụ si ebi ndụ n'ụwa n'ihi na onweghi ihe ga-adịkwa ka ọ dị na mbụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus?" afirika-48190247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48190247,LGs and NFIU: Ego gọọmentị ọ kwaala okpuruọchịchị na-enweghi onyeisioche?,Dịka NFIU kwuru na ndị gọvanọ na Naịjirịa ga-esepu aka n'ego ọkpụrụochichi dị na steeti ha.,"BBC Igbo kpọrọ onye ọkaiwu ka ọ kọwaa etu ihe ga-esi metụta okpuruọchịchị ebe enweghi onyeisioche na-anọchite anya ha. Onye ga na-eketa ego n'aha aha? Ka ọ pụtara na ego gọọmentị agaghị eru ha aka? Chima Nnaji kwuru na ọ dịrị ndị ụlọọrụ Inec na steeti dị icheiche ịhazi ma manye ntụliaka ga-ahọpụta ndị isioche ebe ahụ. O kwukwara na tupu a họpụta ndị ahụ, na o nwere ụfọdụ ndị nwereike ịketa ego maka okpuruọchịchị ndị ahụ. Ndị ọ kpọrọ aha bụ ndị ọdeakwụkwọ kachasị nakwa ndị isi na-achịkọta ndị ọrụ okpuruọchịchị ahụ. Cheta na ngalaba ọhụrụ ehibere maka etu ego si agbasa na Naịjirịa nyere iwu ọhụrụ ka ndị gọvanọ sepụ aka n'ego ndị okpuruọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48220582,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48220582,Nigeria Police: Ụzọ ị ga-esi gbalahụ nsogbu na 'checkpọint',"Gbasapụ ihu ọchị, nwe ile ụtọ ma gbalahụ ịlụsa onye uweojii ọgụ.","Ihe ndị a bụ azụ ndị uweojii Naijiria na-atụpenye ndị ọkwọụgbọala ma ha zute ọgbatauhie ndị uweojii n'okporoụzọ dịka ha siri wepụta n'igwe okwu Twitter ha. O doghị anya ihe mere ha ji wepụta ntuziaka ahụ dị 16 , mana ihe onyonyo na-eme ihere nke gosiri onye ọrụ ha ka ọ na-ahụ ọnụ aka azụ ọ ga a nara nwere ike ịbụ ihe butere ya. N'ihe onyonyo ahụ, onye uweojii ahụ na-ekwu ka enye ya puku naira anọ dịka o kwuru na ego ole onye ahụ kwuru ezughị. Ụdị ihe dị otu emela ka ha gbagbuo ndị ọkwọụgbọala ndị ekweghị na gọọmentị ha. Ndị uweojii ekwughị maka ịna akaazụ na ""ntuziaka maka ezi mmekorịta n'ọgbataụhie n'okporoụzọ"" ahụ mana ha dụrụ ọdụ ka, ""Ka i leruo anya n'aha nakwa akara, ụdị ngwaọgụ nakwa ụdị ụgbọala onye ha bụ ọkachasị ma ọ na-akpa agwa ekwesịghị. Ọ bụrụ na ịka na-eche otu ị ga-esi gbaso ntụzịaka ndịa, lee ihe ọkwọụgbọala kwesịrị ime: Welata ọsọ gị dịka ị na-eru nso ọgbataụhie n'okporoụzọ ndị uweojii, gbanye ọkụ dị n'ime ụgbọala gị ma ọ bụụ n'abalị ma dowe aka gị ebe onye uweojii ga na-ahụ ya. Ịgbalata igwe okwu redio gị ga-adị mma. Ikụsụ onye uweojii dịka ịsị, 'gbaa mụ' abụghị ezigbo ihe. Ya na imetụ onye uweojii aka n'ụzọ ekwesịghị ekwesị: Ndị uweojii kọwapụtara ihe nwere ike iso ịluso onye uweojii ji egbe ọgụ dịka o nwere ike ịgba gị egbe iji chekwa onwe ya: Ọtụtụ ndị Naijiria enweghị ntụkwasaobi na ebe ndị uweojii nọ n'ihi na ha na-ahụta ha dịka ndị amaghị ọrụ ha nakwa ndị na-eme nrụrụaka dịka onye isi Ụlọọrụ ntakụkọ BBC na Naijiria bụ Aliyu Tanko siri kwuo Ụmụ Naijiria na-ekwu na ọgbataụhie n'okporoụzọ ndị uweojii karịị akarị ma bụụ ihe ha jị anapụ ndị mmadụ ego akaazụ. Ndị uweojii Naijiria so na ndị ego ụgwọọnwa ha pekarịchara n'ụwa niile dịụka ha nwekwara nsogbu enweghị ezi ngwaọrụ, dịka onye ntakụkọ anyị siri kwuo. Mana ndị uweojii na-ahụta nsogbu ha na ọha mmadụ na-enwe dịka ihe nghọtahie na-ebute. Ha dụrụ ndị mmadụ ọdụ ka were olu ọma na-eso ndị ọrụ ha.: A na-ahụta ntụzịaka ndịa dịka mbọ ha na-agba iji hụ na e ji anya ọma ele ha. Nke a na-eso mkparịtaụka ha na ndị mmadụ nwere n'igwe okwu social midia. Mana ozi ha wepụtara wetara ndị kwere na ndị ekweghị:" 44484305,https://www.bbc.com/igbo/44484305,Lee ihe iri agbọghọ agba ọhụrụ chọrọ na nwoke ga-alụ ya,Nwaanyị ọbụla toruru agbọghọ nwere ebumnobi ya dịka ụdị ihe ọ chọrọ na nwoke ga-alụ ya.,"Ihe ụmụada Igbo chọrọ na nwoke BBC Igbo gbara ụmụagbọghọ dị bidọ afọ iri na asatọ(18) rue iri abụọ na ise (25) ajụjụ banyere ihe ha chọrọ na nwoke ga-alụ ha. Lee ọkpụrụkpụ ihe ndị pụtara ihe n'ime okwu ọtụtụ n'ime ha kwuru: 1. Ha chọrọ nwoke nwere ego Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ego Agbọghọbịa agba ọhụrụ achọghị ahụhụ ọbụla na be di ya. Dịka Chinaza Ilochi siri kọwaa, ""A chọrọ m onye ji ego, onye ga na-eleta m anya na-eletakwa ụmụ anyị anya. Ọ bụghị na m agaghị akpata ego nke m mana agaghị m elekwasa anya n'ego nke m."" Agbọghọ ọzọ achọghị ka a kpọọ aha ya sị: ""A chọrọ ka di m nwee ego. A chọrọ m 'Assurance', ka o were leta ụmụ anyị anya. O nwere ụdị ọṅụ na-eso ma nwaanyị lụta di nweere ego."" 2. Nwoke gụrụ akwụkwọ Ọ bụrụ na i chere n'ego bụ ebe e jedebere n'ihe niile dị mkpa iji nweta obi agbọghọ agba ọhụrụ, ị mara na ị nọ na mmiri, ncha a na-aba gị anya. Ụmụagbọghọ ugbụa chọrọ nwoke gara akwụkwọ ọ ga-abụ ihe ịgụ akwụkwọ mee, ha ahụ onye ha ga agbakwuru. Ifeanyichukwu Asogwa kwụrụ, ""Achọrọ m nwoke gụrụ akwụkwọ. Onye ga-abụ onye nlereanya nye ụmụ anyị ga-amụ."" 3.Nwoke nwere ịhụnanya Ọ bụghị agboghọ niile bubere nwoke inwe ego ụzọ. O nwere ndị ihe kachasị ha mkpa bụ nwoke hụrụ ha n'anya. "" Achọrọ m nwoke hụrụ m n'anya ma were m ka m dị,"" bụ etu otu agbọghọ sịrị na ọ chọghị nwoke chọrọ ka ya gbanwe siri kọwa ya. 4. Nwoke nwere ezi agwa Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ezi omume. Ogechukwu Agu bụ nwata akwụkwọ nọ n'otu mahadum dị n'ọwụwa-anyanwụ, Naijiria sị: ""Onye na-anaghị ezuzu ezuzu, na-akwanyere onwe ya ugwu. Onye anaghị aṅụ oke mmanya."" 5. Nwoke na-akwanyere nwaanyị ugwu N'okwu otu nwata nwaanyị achọghị ka a kpọ aha ya, nwoke na-akwanyere nwaanyị ugwu. ""A chọrọ nwoke anyị ga-akparịta ụka etu anyị ga- esi ahazị ezinaụlọ anyị. ""Ụfọdụ ụmụnwoke anaghị achọ ige echiche nwunye ha."" 6. Nwoke na-agba mbọ Ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya. Ọtụtụ ụmụnwaanyị achọghị nwoke dị umengwụ, ori ka dimkpa, ọrụ ka ngwụrọ. ""Ọ bụrụgodi na ọ na-arụ ọrụ, na-enweta ego, agbọghọ ugbua achọghị nwoke ọ ga na-enye nri, nwoke nọ na 'weta-ka-e-rie.' Ọ bụghị etu a mkparị nwere ike iso ya. 7. Nwoke dị mma ile anya ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya. Ọ bụghị naanị nwoke chọrọ onye mara mma, ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya. N'ụwa ugbua, naanị onye jọrọ njọ bụ onye anaghị eleta onwe ya anya. Otu agboghọ sịrị : ""Achọghị m ịlụ onye mkpụmkpụ. A chọrọ m onye chatụrụ ọcha. A chọghị m onye dị ojii."" 8. Nwoke na-atụ egwu Chineke Ụfọdụ ụmụnwaanyị chọrọ nwoke na-atụ Chukwu egwu. Favour Nwachukwu sịrị: ""A chọrọ m nwoke ga na-atụ Chineke ụjọ."" 9. Nwoke anya ya dị n'ụlọ Agbọghọ ugbua nụ kepukepu na o nwere ihe jịkọrọ nwoke ya na nwaanyị ọzọ, ọkpọ a bụrụ n'anya Agbanyeghị na nwoke mara mma, na-agba mbọ, ma nwee ego, o nweghị nwaanyị chọrọ nwoke na-agba n'iro. N'oge gboo, nwoke nwere ohere iso nwaanyị ole masiri ya, ebe nwaanyị ya agaghị enwe ọnụ okwu ma ọ bụ mgbaka ahụ ọbụla maka ya. Mana agbọghọ ugbua agaghị eji anya ya hụ maọbụ jiri ntị ya nụ na di ya na-agba n'iro. Ọ nụ kepukepu na o nwere ihe jịkọrọ nwoke ya na nwaanyị ọzọ, ọkpọ a bụrụ n'anya. 10: Nwoke na-eme ọgọ Ụmụnwaanyị achọghị nwoke anaghị eri eri, onye dị akpịkpị. Ọ na-esiri nwoke bụ erieri ike inweta obi nwaanyị. Chinaza kwuru, ""A chọrọ m nwoke na-adịghị aka chịchịchị."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47016394,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47016394,Sex Education: E kwesịrị ikuziri nwatakịrị maka 'mmekọ nwoke na nwaanyị'?,"Ebe ụfọdụ anaghị asọ nsọ na mmadụ bụ ezigbo nwatakịrị tupu ha edina ha, ọ kwesịrị ka a kụziere ụmụaka ihe dị na mmekọrịta nwoke na nwaanyị?","Maka etu ụwa si eme ntụgharị ugbua, ụfọdụ ndị nne na nna anaghị enwezị ntụkwasị obi n'elu ndị okenye na-elekọta ụmụaka ha. Mgbe mbụ, ndị Igbo kwenyere na ọ na-ewe otu obodo ịzụ nwa, mana etu ụwa si dagharịa ugbua, ụfọdụ anaghị ekwe ewepụ anya ha n'ebe ụmụ ha nọ maka ndị nwereike ime ha ihe ọjọọ dịka idina ha n'ike maọbụ imetụ ha aka etu ekwesịghị. BBC kpọkuru Pamela Udoka bụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị; o kwuru na ọ na-adị mma ibido na nwata kuziwere ụmụaka maka ahụ ha. Udoka kwuru na nwatakịrị mara maka ahụ ya, ọ ga-adịrị ya mfe ikwulite okwu ma mmadụ malite ịmetụ ya aka etu a na-ekwesịghị. A jụrụ ya afọ ole nwatakịrị ga-etoru tupu nne na nna akụziwere ya maka ihe gbasara mmekọrịta a. O kwuru sị na ọ na-aka mma ozugbo nwatakịrị bidoro ịghọta ihe okenye na-ekwu, nke na-abụkarị ihe dị ka afọ atọ. Ihe ị ga-akuziri nwa gị maka mmekọ Ezola ọnụ ma ị na-akụziri ha maka ahụ ha, makana ọ bụrụ na ị kuzighịri ha, ha ga-amụta ya ebe ọzọ, nke nwere ike ibute nsogbu. Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?" afirika-52001040,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52001040,Coronavirus: Lee ndị njọ ahịa na-egbuzi kamgbe ọrịa a malitere,"Kamgbe ọrịa coronvirus malitere, akụnụba mba ụwa akụọla afọ n'ala.","Adeboye onyeisi ụka Redeem kara ụka n'okpokoro ụlọụka n'izuụka gara aga Ọtụtụ ahịa anaghịkwa aga aga, mana ụfodụ bụkwa ugbua ka ha ji agbazi nke bụ aka ahịa. Mba dị icheiche n'ụwa nakwa steeti dị iche iche na Naịjirịa amachiela ọgbakọ ndị mmadụ. Nke a mere ka ụfọdụ na-ekwu na ndị ụkọchukwu na ndị amụma ga-ebuzi ọnụ. Ma lee ihe ndị ọzọ na-ebe akwa kamgbe ọrịa coronavirus malitere: Ndị ụka Ụlọụka RCCG dị n'Ikoyi kwuru na ha emechiela Dịka amachirila ọgbakọ ebe ndị mmadụ buru ibu, ya bụ ihe metụtakwara ndị ụka. N'ụbọchị Sọnde gara aga, ọtụtụ ụlọụka na Legọs gbachiri agbachi. Ọbụghị sọ na Legọs, ọtụtụ steeti na Naịjirịa amachiela ụka n'ihi na ndị mmadụ na-agbakọ ebe ahụ. Nke a mere ndị mmadụ ji ekwu na ndị ụkọchukwu na ndị amụma ga-ahụ nke tọrọ fada. Ha na ekwu na dịka ndị ụka anaghịzi abịa, ego onyinye na ego 'tithe' alaala. Ụkọchukwu ọ ga-emezi aghaa? 'Betting' Tupu coronavirus amalite, ngwụcha izuụka niile na-ekpo ọkụ na Naịjirịa n'ihi ọtụtụ asọmpi egwuregwu bọọlụ. Ọbụghị naanị ikiri bọọlụ na-eme ndị mmadụ obi ọma, nke ọzọ bụ itinye ego iji kaa ndị nwere ike imeri. Ọ bụ nke a ka a na-akpọ 'betting na bekee. Mana coronavirus emeela ka amachie egwuregwu niile. Nke pụtara na ndị nwere ụlọahịa maka 'betting' nọzị na nnukwu njọ ahịa ugbu a. Ebe nkiri bọọlụ (viewing centres) N'ihi na ọkụ latrik anaghị adịkarị, ọtụtụ na-ahapụ ụlọ ha gaa ebe ha ga-anọ ekiri bọọlụ. Mana kamgbe a kwụsịrị asọmpi niile, onye ọbụla nọzị be ya. Ndị nwere ụlọ ebe a na-ekriri bọọlụ wee bụrụzie Erọn gbara aka laa. Ụlọ nkwụ/Ụlọ ite egwu Onwekwaghị onye na-achọ ịga ebe a na aṅụ nkwụ maọbụ agba egwu nke Bekee kpọrọ 'bars' na 'clubs'. Ọrịa coronavirus achọghị mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya ma ncha ma ncha. Gịnịzi ka ndị nwere 'bar' na 'club' ga-emezi ugbua? Ndị nhazi mmemme Bekee na-akpọ ha 'event planners', mana njọ ahịa na-ajọgbu ha kịtaa. Gọọmentị steeti dị icheiche amachiela ọgbakọ karịrị mmadụ iri ise, nke pụtara na a ga-akagbu maọbụ yighaa nnukwu mmemme ọbụla. Onye 'event planner' ọ ga-ebuzi ọnụ? Ndị ọkwọ ụgbọala Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego Otu onye ọkwọ ụgbọala aha ya bụ Lincoln Idowu gwara BBC Igbo na njọ ahịa na-ajọgbu ha ugbua. Idowu na-akwọ ụgbọala 'Uber' na Legọs. O kwuru sị: ""N'oge mbụ anyị na-aga ọdọụgbọelu gaa buga maọbụ bulata ndị njem ihe ruru ugboro atọ n'otu ụbọchị."" ""Mmadụ nwere ike inweta ihe ruru puku naịra 30 n'otu ụbọchị, mana ugbua onweghi ihe anyị na-ahụzi."" Lekwa ndị na-ebuba ego nke ọma n'oge a Ndị ahịa nri Onye ọbụla na-ego ihe nri na-edebe Dịka a na-atụ egwu na gọọmentị nwere ike ịkpọchikọrọ elu na ala, ọtụtụ ndị mmadụ na-ego ihe nri n'ike n'ike. Ka ọ ga-abụ opi ike gbuo, ka ha nwee nri ha na ezinụlọ ha ga na-eri ruo mgbe ikuku ọjọo a kuchara. Ndị ahịa oroma nkịrịsị Kepukepu na-ekwu na oroma nkịrịsị na mmanụ aṅụ a gwọkọrọ ọnụ na-enye aka maka ndị nwere ọrịa coronavirus. Ọ bụ eziokwu na ndị ọkachamara ekwupụtabeghi nke a, ọtụtụ dnị mmadụ egojuola oroma nkịrịsị na be ha. Ndị ụlọọrụ nzikọrịta ozi ekwentị Ọtụtụ nọzị n'ụlọ ha arụ ọrụ n'ihi egwu maka coronavirus Ọtụtụ ndị mmadụ si n'ụlọ ha arụ ọrụ ugbua ọkacha na Legọs nakwa Abuja. Nke a pụtara na ndị mmadụ ga na-emefu nnukwu ego iji gote akara ịntaneetị. Ebee ka ego niile ahụ na-aba? Ihe ị machakwa. Ndị 'super market' Ụlọahịa 'super market' na-eju n'ọnụ n'oge a Ndị nwere 'super market' na-agba nnọọ nnukwu aka ahịa n'oge a. Ndị mmadụ na-ejupụta n'ọnụ na-azụrụ ihe dị mkpa iji cheere coronavirus aka mgba. Akwụkwọ mposi nke bekee kpọrọ 'toilet tissue', mmiri nsacha aka pụrụ iche (hand sanitizer), nakwa akwa mkpuchi ihu (face mask) na-aga ahaịa nke ọma ugbua. Ọtụtụ n'ime ha etinyela ego buru ibu, mana ndị mmadụ ka na-abụ ya ụbụ. Ndị ahịa kọmputa Ọtụtụ ndị na-achọghị ịpụ n'ụlọ ha bụ na ịntaneetị ka ha na-azụrụ ihe dị ha mkpa. Ya mere na ndị dịka 'jumia' maọbụ 'konga' na-amụrị ugbua. Dịka Igbo si atụ n'ilu, ala adịghị mma bụ uru ndị nze. Ihe ọbụla mere n'ụwa nwere ndị ọ ga-adabara." afirika-48815639,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48815639,RUGA Settlement: Ụmụ Naịjirịa agbarụọla ihu ọzọ maka atụmatụ a,Ọtụtụ mmadụ gosipụtara iwe n'elu soshal midia na-akpọ oku ka gọọmentị etiti machie atụmatụ RUGA settlement ha na-akwado ịmalite.,"Ha ji nke Bekee kpọr hashtag #SaynotoRUGA were depụta ihe dị ha n'obi gbasara ya. Lee ihe ndị ha kwuru ebe a Aremu kwuru na atụmatụ a adịghị ka ihe gọọmentị etiti chere ọfụma tupu ha ewepụta. End of Twitter post, 1 Damixo kwuru na ịchị ehi bụ ọrụ mmadụ na-arụrụ onwe n'agbasaghị gọọmentị chaa chaa. Ebe Khalid na-ekwua ka ndị mmadụ gba mbọ ghọta RUGA tupu ha egosi iwe ha. Ọzọ, Ndị mmadụ pụtara ịkwado COZA na ngagharị iwe emere megide ha taa n'Abuja nakwa Legọs. Ụfọdụ ndị echere na ha bụ ndị COZA pụtara ịkwado ụkọchukwu ha bụ Biodun Fatoyinbo taa. Ebe ndị mmadụ boro ụlọụka ahụ ebubo na ha gobiri ndị agboro bịa nọchite anya ha. Ndị otu egwu Super Eagles ka ha mechara nkwado ha. Ndị otu egwu Super Eagles nke Naijiria ga-ezute mba Madagaska na asọmpi iko mba Afrịka a kpọrọ 'Africa Cup of Nations' taa. Asọmpi nke taa ka a ga eji mara ndị ga-abụ ndị nke mbụ n'otu 'Group B'. Naijiria meriri mba Burundi nakwa Guinea na asọmpị abụọ gara aga iji nweta akara isii. N'aka nke ọzọ Madagascar meriri Burundi, ebe ha na Guinea gbara nhatanha (2-2) nke mere ka ha nweta akara anọ. Ahmed Musa bụ osote onye ndu Super Eagles kwuru na ha ga-anwa ike ha iji bulata iko AFCON nke afọ a na-agbanyeghi na a ka ji ha ụgwọ nke ha gbarala agba. Gịnị na-akpata ebighi n'udo? Onyeisiala Muhammadu Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari ebidola nrụrịtaụka iji wee kpokọba kọmiti ga-ahụ maka inyocha ihe na-ebute nwakpo dị n'etiti agbụrụ na agbụrụ ma kwụsị ya bụ ọdachị. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ onyeisiala bụ Garba Shehu kọwara na otu a ga-agụnye ndị ọrụ nchekwa, ndị okpukperechi, ndị ọrụ ugbo, ndị na-achụ nta ,ndị ụlọọrụ okpuruọchịchị nakwa ndị eze ọdịnaala.. Iweta nchekwa na-emefughi ego Rochas Okorocha Aka chiburu Steeti Imo bụ Rochas Okorocha ekwuola na ohi na ntọ ga-ebelata na Naijiria ma ọbụrụ na gọọmenti were ọrụ nchekwa nyefee ndị eze ọdịnala n'aka. O kwuru na ọbụ etu a ka o si wulie nchekwa na Imo na-emefughi nnukwu ego ọbụla oge ọ bụ gọvanọ steeti ahụ. Na mba ofesi Donald Trump na Kim Jong-Un Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ezutela ogbo ya nke mba Nọt Koria bu Kim Jong Un. Ndị isiala abụọ ahụ zutere n'oke ala jikọrọ mba Saut Koria na Nọt Koria nwa mgbe nta n'ụtụtụ taa bụ abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2019. Trump bụ onye nọ njem nleta na Saut Koria kwuburu na ọ ga amasị ya ma ya na Kim Jong Un kelee onwe ha iji gosi na onweghi esemokwu di n'etiti ha abụọ. N'egwuregwu Ndị otu egwu bọọlụ nke mba Ghana na ndi Cameroon gbara onwe ha onye lawa onye lawa na asọmpi AFCON nke ha gbara ụnyaahụ. Nke a pụtara na Cameroon ka bụkwa ndị nke mbụ na otu 'Group F' n'ihi na ha nwere akara anọ ebe Ghana nwere nanị akara abụọ. Ghana ga-ezute Guinea Bissau ebe Cameroon ga-ezute Benin Republic ụbọchị Tuuzdee iji mara ndị ga-agafe n'agba nke abụọ. Ndị otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Sweden N'iko mba ụwa ụmụnwanyị, mba Sweden mere ihe tụrụ mmadụ n'anya mgbe ha ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee dulaa mba Jamani ụnyaahu. Sweden na Netherlands ga-achịpụ ya ebe mba Ingland na Amerịka ga-ezute na agba nke 'Semi final' ụbọchị Tuuzdee na Wenezdee. Akụkọ ga-amasị gị: Onye ọja Gerald Eze" afirika-47196758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47196758,Nigeria Election 2019: I nwere ike iji mkpịsịaka obụla masịrị gị tụọ vootu - INEC,"Dịka ụbọchị ntụliaka afọ 2019 na-eru nso, ụlọọrụ INEC e kwupụtala na onye ọbụla tozuru oke ime ntụliaka nwereike iji mkpịsịaka masịrị ya were tụọ vootu .","Mkpịsịaka e nwere ike iji tụọ vootu Onyeisi ngalaba ụlọọrụ INEC na-ahụ maka nkụzi na ntụziaka nye ọhanaeze bụ Ijeọma Igbokwe, na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere kọwara, na ọbụghị iwu na e nwere mkpịsịaka e wepụtara maka iji tụọ vootu. O kwuru na mkpịsịaka ọbụla ga-eme ka ọnyeahụ nweta ihe achọrọ na ntụliaka bụ nke a ga-anabata n'oge atụm vootu. Ijeọma Igbokwe kwukwara na ihe mere eji wepụta atụmatụ a bụ i ji nyere ndị na-enweghị mkpịsịaka zuru ezu aka iji sonye na ntụliaka a na-abịa. PVC ndị anatabeghị Ọ gwakwara ndị ga-eme ntụliaka ka ha gbalịa hụ na ha bịanyere aka n'ohere e mebere maka nke a iji gbanahụ ịkagbu vootu ha. Na ntụnye ya gbasara nnwakpo ndị a na-eme megide ụlọọrụ INEC na-ebe dị iche iche, o kwuru na ụlọọrụ INEC e nyeela mkpesa gbasara nke a n'aka ndị uweojii. O kwukwara na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji kwụsị ajọ ọnọdụ a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44963073,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44963073,"""Buhari oge mgbanwe eruola"" - Fr. Mbaka",Ụkọchukwu a ma ama bụ Rev Fr. Ejike Mbaka ezigarala onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ozi na 'iwe Chineke adịla ọkụ n'ebe ọ nọ maka ọchịchị ya'.,"Fr. Mbaka ji oke iwe baara Buhari mba na ọ gbara nkịtị a na-egbu ụmụ Naịjirịa ka ha a bụ anụmanụ. Ọ rụrụ Buhari aka ma kwuo na ọchịchị ya bụ 'demon-cracy' kama 'democracy' n'ihi na o meghi ka onye nkwafu ọbara mmadụ na-emetụta n'ahụ.O kwuru na oge eruola mgbe Chineke ga-ewepụ mkpara onye iro bụ ekwensu n'ala ụmụ ya na Naịjirịa. Mbaka wepụtara ozi a oge ọ na-ezi oziọma ụbọchị ụka gara aga n'Adoration o mere n'Enugwu steeti, nakwa ekpere o mere n'ụbọchị gara aga a kpọrọ ""I no dey again"" na Bekee. Ọ kpọrọ ozi nke o zisara n'ụbọchị ụka 'Disaster is coming', ebe nke ụbọchị garaga bụ 'Change is coming'. Ka ọ na ekwuputa ya bụ amụma, Mbaka ji egwu na mkpu akwa kwuputa na ọbara ndị ụkọchukwu abụọ egburu na Benue steeti nakwa ndụ ndị mmadụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi lara n'iyi, abụrụla amamikpe dịịrị gọọmenti nọ ugbua. Buhari ga-achịrịrị ọzọ -Wogu Mbaka gwara onyeisiala na ebe ọ bụ na ọrụ adighị, ọkụ latrik adighị, ọ naghị akwụsị ikwafu obara ndị a na-enyo na ha bụ ọchịehi na ndị ọzọ na akwafu, na o kwesịghị ị na-arahụzi ụra ugbua maka na ""oge mgbanwe eruola"". Mbaka gbarụrụ ihu ma kwuo na ndị ọchịchị niile nọ ugbua bụ otu ndị ahụ gburu Naịjiria, ha bụ agada gbachiri ụzọ na-ekweghị ka ndị ga-edozi obodo bata. N'ihi nkea, o kwuru na eluigwe enyochaala gọọmentị Naịjirịa wee chọpụta na ọ na-eri nnukwu mperi. O mechiri okwu ya site n'ikwu na onweghị okpukperechi ga-agbapụrụ ibe ya na Naịjiria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43680589,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43680589,Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Super Falcons kpọchuru ajọọ ihu ụnyahụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa. ' Social media' nwuru ọkụ maka Aisha Wakil,"Aisha Wakil kwuru na Bokoharam ga-atọghapu nwa Dapchi akpọrọ Leah Sharibu Kamgbe Aisha Wakil kọwachara BBC Igbo n'asụsụ Igbo ka ya ndị oyi egwu a sị akpa,ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu uche ha na igwe okwu 'social media'. pia ebe a kị ihụ ya. France 8 Super Falcons 0 Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ Ụmụnwaanyị egwu bọlụ nke Naịjirịa bụ Super Falcons na nke ndị France sọrọmpi enyi na enyi ụnyahụ bụ Fraide. Ya bụ mpi ha sọrọ kpọrọ ndị super Falcons ihụ ọjọọ site na ịgba ha ọkpụ asatọ chara acha na ọgbọ egwuruegwu MMArena na Le Mans, France. Gọvanọ Ọbialọ kwuputara mkpa ọdị ịkwado agaumakwụkwọ Willie Obialo bụ Gọvanọ Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obialo nke Anambra Steeti ekwupụtala mkpa ọdị ịkwalite agụm akwụkwọ na steeti ahụ. Okwuru nke a ụnyahụ mgbe ọ gara emụme nkwado agụm akwụkwọ nke ndị Onyebuchi Chris Ifediora Foundation kpokobara na Aguleri. Onye nọchite anya ya na ya bụ emume bụ Joy Ulasi kwuru ọdịghị mma ị hapụrụ nanị gọọmenti ọrụ gbasara agụm akwụkwọ. Ndị uweojii London akasiela ndị mmadụ obi na London Agbagburu mmadu 6 na London n'izu gara aga Na mba ofesi, ozị sị London erụ anyị ntị sị na-ezipula ndị ụweojii narị atọ na ọgbe ndị omekaome kacha akpa ike. Egburu mmadụ 6 ma merukwa ụfọdụ ahụ na mpaghara London ụfọdụ n'izụụka gara aga. EU ekwetala ịkwado agha a na ebuso mpụ ọzọ Ndị a bụ agba nke abụọ ya EU na akwado agha a na-ebuso ndị omekome na Naịjirịa Ndị otu European union a ekwuputela mkpebi ha ịkwado agha a na-alụ megide ndị omekataraihepuujọ na Naịjirịa. Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ United Nations na-ahu maka ọgwụ na mpụ bụ Sylvester Atere kwuru na nkwado nke a ga erụ afọ 3. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Kedụ aha ụtọ ị na-etu onye ị hụrụ n'anya?" afirika-51076588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51076588,Ọkụ ereela Mgbuka Obosi tọọ tọọ,"Ngalaba mmenyụ ọkụ n'Anambara bu ""Anambra Fire Service"" si na ọkụ gbara ahịa Mgbuka Obosi dị Anambara steeti tara akpu maka ụdịrị ihe a na-ere ebe ahu nke mere imenyụ ya jiri rịa ahụ.","N'ozi ha dere n'akara Facebook ha, ngalaba sị na ha mere ọsịsọ gbagawa Mgbuka Obosi oge ha nụru na ọkụ na-agba ebe ahụ. Ha sị na amabeghi ihe kpatara ya bu ọkụ ma sịkwa na onweghi onye nwụru na ya kama ngwa ahịa o mebiri ka nkụ. ""Ọ bụ ihe na-ere ọkụ n'ike di n'ahịa ahụ mere ọku a jiri karịa mana anyi gbanyụru ya."" Jamb akagbuola atumatụ NIN maka ule 2020 Ngalaba na-ahụ maka ule mahadum na Naịjirịa bụ ""Joint Admissions and Matriculation Board"" (Jamb) akwụsịla atụmatu ha jiri si na ọ bụ iwu na ndi chọrọ ile ule mahadum ga-enwerịrị akara ọnụọgụ ejirimara Bekee kpọrọ ""National Identification Number"" (NIN) tupu ha edenye aha ule nke 2020. Onyeisi Jamb bụ Ishaq Oloyede kwuru nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja ụbọchị Satọde. Ọ sị na ha kagburu atụmatụ iji nye ụmụakwụkwọ ohere ịgbata akara njirimara NIN a. Ọ sịkwa na nwezuga a ga-enye aka hụ na nsogbu ha nwere n'ụfọdụ ebe a na-agbata akwụkwọ ule bu ihe gara aga. Maazị Oloyede sị na iji NIN denye aha ga-abụrụ usoro ule nke 2021. Jamb sị na ọ bụ maka ịkwụsị ndi mmadụ idenye aha karịa otu ugboro kpatara ha jiri wete atụmatụ. Ọtụtụ ihe gọọmentị na-emekwa chọrọ akara NIN a tupu ọ gaa n'ihu. Atụmatụ a Jamb weputara tinyere ọtụtụ ndi chọrị ide ule n'ezigbote ahụhụ dika BBC hụrụ n'ebe a. Gọọmentị Buhari di Ọwụwa Anyanwụ mma na-alụ Chris Ngige na-arụ dịka Minịsta na-ahu maka ọrụ Onye kwuru nke bụ Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ka ọ na-etinye ọnụ na ọnọdụ ndị Igbo n'ọchịchị Muhammadu Buhari Ngige sị na ihe Buhari rụrụ n'ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'afọ ise karịrị ihe PD rụru n'afọ iri na itoolu ha chịrị. Delta steeti na ụgwọ opekete mpe Delta steeti ekwuola na ha amaliteka ikwụ ụgwo opekete mpe Gọọmentị Delta steeti etinyela aka n'akwụkwọ were kwuo na ha ga-ebido ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ obekete mpe dịka gọomenti etiti si hiwe . Ha kwụrụ nke a dịka ha na ngalaba na-ahu maka ndị ọrụ nke Delta steeti nwere nzụkọ ma kwuo na ndị ọrụ ga-erite elele a site n'ọnwa Nọvemba 2019 were gawa n'ihu. N'Ofesi Tsai Ing-wen emeriela Tsai Ing-wen Tsai Ing-wen emeriela dịka onyeisiala mba Taiwan. Nkea ga-eme ya gba nke abụọ ya. Nke a na-abịa n'azụ ọgbaghara maka okwu ọnọdụ ogbo ha bụ Hong Kong na Chaina. Dịka Hong Kong, ụfọdụ ndi Taiwan chọrọ ka ha nwere onwe ha, ebe ụfọdụ chọrọ ka ha laghachi sonye na Chaina. Canada na ụgbọelu mba Ukraine gbaturu Mmadụ niile nọ na ya bụ ụgboelu nwụrụ Gọọmentị mba Kanada ekwuola na ihe ka mkpa ugbua bụ ka ịhụ na ndị nwụrụ n'ụgbọelu Yukren Iran gbaturu anwụghi n'efu. Mmadụ iri ise na asaa si mba Kanada so n'ime mmadụ otu narị na iri asaa na isii nwụrụ n'ọdachi a. Eze ndị mba Oman anwụọla Qaboos bin Said Eze ndị mba Oman bụ Qaboos bin Said anwụọla. Said dị afọ iri asaa na itolu ma bụrụ kwa ọnye ọchịchi Arab kacha kaa nka n'ụwa niile tupu ọ nwụọ. N'egwuregwu, Arsenal na Crystal Palace ji ọtụ ọkpụ goolu otu ọkpụ goolu were mechie asọmpị ha Egbe ndị Arsenal ka na-ada chamcham dịka ha gara na be ndị otu egwu bọọlụ Crystal palace ebe ha abụo a ji otu ọkpụ goolu otu ọgbu goolu were maa onwe ha aka. Ebe ndi Chelsea ji ọkpu goolu ano asataghi ma otu were mere ndị Burnley oji. Ndị Man Utd wara anya n'ike dika ha jiri ọkpụ goolu anọ were meria ndi otu egwu Norwich. Leicester City gbara ọnyụpa dịka ndị Brighton ji otu goolu were merie ha n'azụ ụlọ ha. Ndị otu egwu bọolụ Liverpool ka nọ n'oche Eze Premiership dịka ha jị otu ọkpui goolu were merie ndi Tottenham." 47172613,https://www.bbc.com/igbo/47172613,Nigeria Elections 2019: Ihe ise bụ ọgbaraigbogharị merela,Ntuliaka na Naijiria bụ egwu agwara ọgwa nke bụ na chị bọọ a nụ ọzọ.,"Mana o nwere ihe ndị mere nke ọ bụrụ na dịbịa gbara ya n'afa, ọtụtụ ga-asị na ya bụ dibịa amaghị ọrụ n'ihi ka ha siri tụọ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya . Lee ụfọdụ n'ime ha: 1. Oby Ezekwesili chịsara ọwa n'ọsọ onyeisiala Ọ gbara ọsọ achụmta vootu ya dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ACPN ka dịmkpa. Ọ gara ọtụtụ obodo, ya na otu dị che iche mere ọgbakọ, ebe o nwe mkparịaụka ya na ndị ntaakụkọ ịgwa ọha ebumnuche ya. Mana ka ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka e mee ntuliaka, Oby Ezekwesili chịsara ọwa. O kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka ya na ndị ọzọ jikọta aka ọnụ were chutuo otu APC na PDP n'ọchịchị. Ọ rịọrọ ndị kwenyere ya mgbaghara. Oge o jiri mee ya na ihe o kwuru kpatara ya tụrụ ndị mmadụ n'anya. O wutere ụfọdụ chere na ya na Kingsley Moghalu bụ ndị nwere ntozu ịzọpụta Naijiria n'ime ndị sonyere na ndọrịtaụka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala e mere ụbọchị January 19. 2. Pati ACPN ikwado Buhari na 2019 Ka ndị mmadụ ka na-eche ihe eme Ezekwesili ijiri gbanyụọ ọkụ oge e chere na ọ ga ekwo ụra ekwo, pati ya bụ ACPN dọnyere Buhari ukwu maka 2019. Ekwesili kwuru na agwa pati ya kpara naanị ka ọ gachara otu abalị ya rituru gosiri na ihe ha ga-erita ka ha mkpa karia ọdịmma Naijiria. 3. Red Card ịdonyere Atiku ukwu Otu Red Card bụ otu Ezekwesili bụ isi e jiri kwawa okpu ha maka ịnapụ otu APC na PDP ọchịchị tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwuru na ha na-akwado Atiku na ntuliaka 2019. Ha kwuru na nke bụ iji 'zọpụta naijiria site na-ibido na-enyere Atiku na Obi nkwado. Ndị mmadụ katọrọ ACPN na Red Card maka ire onwe ha n'ihi ihe nweta. 4. SDP idonyere Buhari ukwu Donald Duke kwuru na ya ka nọ n'ọsọ onyeisiala Oge ha pụtara, ihe ha gwara ụmụ Naijiria bụ na ha bụ otu ga-anapụ APC na PDP ọchịchị dịka 'Third Force'. Mana pati ahụ tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwụpụtara na ọ bụ Muhammadu Buhari na APC ka ha ga-eso. gbahapụ Donald Duke bụ onye pati ahụ họpịtara ka ọzọ ọkwa onyeisiala n'aha. Ihe adịghị Duke mma, o kwuru na ya ka n'ọsọ onyeisiala. Otu SDP nọ n'ụlọikpe kemgbe Jerry Gana gbara ha akwụkwọ sị ka eme ya onye na-anọchite SDP n'ọkwa onyeisiala. Gana meriri n'ụlọikpe ukwu mana ụlọikpe mkpeharị nyere Duke mmeri. 5. Nwaanyị mụrụ nwa n'ọsọ achumta vootu Otu nwaanyị a kpọrọ Odiri Imuere mụrụ nwa na Delta steeti oge gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Okowa nke PDP gara achụmta vootu n'Okpuru Ọchịchị Ogboru,Delta steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" 42791249,https://www.bbc.com/igbo/42791249,Ụkọrọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa: 'Iwe ji anynị',Ụfọdụ ọdọ mmanụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa na-ere mmanụ ụgbọala karịa narị naịra abụọ.,"Ndị nwe ụgbọala na-achọ ụzọ ọbụla inweta mmanụ ụgbọala Ụkọ mmanụ ụgbọala alaghachiala na steeti dị iche iche na Naịjirịa ebe ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na ọtụtụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọ-ala anaghị ere ebe ndị na-ere anaghị ere n'ọnụ gọọmenti wepụtara. Ha gara na igwe mgbasa ozi twitter we kwuputa ka ukọ mmanụ ụgbọala sị emekpa ha ahụ. Ha katọkwara gọọmentị etiti. Ụlọ ọrụ na-ere mmanụ na Naịjirịa bụ NNPC ekwuola na ụlọ mmanụ ha dị na steeti dị ichiche na Naịjirịa na-ere mmanụ n'ọnụ ego kwesiri nụ. Gụrụ ihe ha na-ekwu na Twitter. Kee mgbe ahụhụ a ga-ebi? Ajụjụ ndị Naịjirịa kpụ n'ọnụ Ụfọdụ na-ajụ mgbe ahụhụ a ga-ebe: N'izu gara aga, onye isi Sineeti bụ Bukola Saraki kwere na ọ bụrụ na etnye akwụkwọ PIGB ka ọ bụrụ iwu ọ ga-ebelata nsogbu ụkọ mmanụ site na- ịkwụsi mmerụaka,izupu mmanụ petrolu:" afirika-45074410,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45074410,Okorocha: Ndị ntoroọbịa nwere ikike ịhọpụta onye ga-achị,Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha agwala ụmụafọ Igbo na ọ bụrụ na Buhari merie na ntuliaka afọ 2019 na ọ bụ mmeri nye ndị Igbo.,"Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo Okorocha kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị ntoroọbịa na ụmụnwaayị pati APC nke mpaghara ọwụwaanyanwụ nwere na ngwụcha izuụka. O kwuru na ndị Igbo na-aghọtaghe ụdịdị mmadụ Buhari, kwuo na Buhari bụ ezigbo mmadụ, ezigbo onye ndu obi ruru ala. Ọ gara n'ihu gwa ndị ntoroọbịa na ndị nne na ikike ịhọpụta ọnye ọchịchị dị ha n'aka dịka ọ kpọkuru ha ka ha saa anya na mmiri na ntuliaka dị n'ihu. N'okwu ya "" Mmeri Buhari bụ mmeri ndị Igbo, agaghị achọ anyị achọ n'ọgbọ ndọrọndọrọ ọchịhchị nke Naịjirịa. Ka anyị mezie ihe anyị mebiri n'afọ 2015 site na ndị ntoroọbịa na ndị nne ime ihe ha kwesiri ha ime."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51687688,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51687688,Afghan Peace Deal: Amerịka na ndị Taliban enwela nkwekọrịta ịkwusị agha,Ebinyela aka na nkwekọrịta e mere eji hụ na agha mba Amerịka na-ebuso ndị Taliban n'Afghanistan bịara na njedebe.,"Nkwekọrịta a enwere na mba Qatar ga-ahụkwa na ndị Afghanistan n'onwe ha malitere mkparịta udo. Ọ bụ mkparịta ụka Amerịka na Taliban butere nkwekọrịta a. Onye na-anọchite anya Taliban na Qatar bụ Mullah Abdul Ghani Baradarsị na he di nkwadobe ị hụ na e mere ihe niile e kwesịrri ịhụ na nkwekọrịta kwuru ọfụma. s Mba Amerịka n'onwe ha na mba Afghanistan wepụtara akwụkwọ ozi gosiri mkpebi ịmalite iwepu ndị agha Amerịka na mba ahụ ruo 8600 n'ime abalị 135, ma hụ na onweghi onye agha Amerika fọrọ na mba ahụ n'ime ọnwa 14. Ihe mere Onyeisiala Buhari ji nye onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbaghara ndị Naịja Delta ezumike Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'atụmatụ inye onyeisi ngalaba akpọrọ Presidential Amnesty Programme bụ Charles Dokubo ezumike nwamgbenta. Ezumike a e nyere Maazị Dokubo ga-enye kọmiti gọọmentị họpụtara ohere ka ha nyocha ebubo mpụ na nrrụrụaka eboro ya. Ọ bụ onye na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina binyere aka n'akwụkwọ bu akụkọ. Ọ bụ n'afọ 2018 ka e nyere Maazị Dokubo ọkwa a dịka a chụrụ Paul Boroh n'ọrụ maka ebubo nrụrụaka kwa. N'Ofesi Ndị na-echekwa onwe ha maka ọrịa Covid-19 na Legọs Ngalaba na-ahụ maka ahụike ụwa niile bụ WHO ekwuola na obi dị ha ụtọ etu Naijirịa si alụsọ ọrịa Coronavirus ọgụ. Ọ bụ onye na-anọchite anya ngalaba a na Naijirịa bụ Peter Clement kwuru nke a ma dọo aka na ntị were sị na akụkọ asị ga-ebute mgbasa ọrịa . Clement kwukwara were sị ka ụlọọgwụ ndị nọrọ onwe ha na gọọmentị rụkọọ ọrụ ọnụ n'ihi na ndị ụlọorụ ahuike na-amaghị maka ọrịa Coronavirus na enyere aka ị gbasa ya bụ ọrịa. Adọtiela ntuliaka Guinea ruo izuụka abụọ Onyeisi ala mba Guinea bụ Alpha Conde ekwuputela na ntuliaka kwesiri imalite na mba ahụ echi ga adọtị aka ruo izuụka abụọ Ntuliaka a ga-abu nke a ga-eji mara ma a ga-agbanwe iwu mba Guinea ji nye ohere na Conde dị afọ iri asatọ na otu soro zụọ ọchịchị ọzọ. Fifa ga-akagbu asompị Gianni Infantino weghara ọchịchị n'aka Sep Blatter n'afọ 2016 Onyeisi Fifa bụ Gianni Ifantino ekwuola na ha nwereike kwagbuo asọmpị dị ichị ichi ekwesiri ịgba n'ọnwa Maachị gunyere nke eji ahọputa ndị ga-esonye sụọ mpị EURO 2020 Ọ sị na nke a bụ maka nje Coronavirus na eferagharị na ọ tụtu mba. Ufọ otu egwuregwu ejirila maka ya kagbuo ikwe n'aka n'asọmpi." media-43927862,https://www.bbc.com/igbo/media-43927862,Akụkọ kachasị n'abalị a: Buhari rituo n'ọkwa ọchịchị - Ndị ụkọchukwu Katolik,Akụkọ kachasị n'abalị a Ndị ụkọchukwu akatọọla Moham m adu Buhari,"Ndị ụkọchukwu katolik ekwuola na oge eruola Muhammadu Buhari ritu n'ọkwa ọchichị dika onye isi ala Naijiria maka ndị ọchịehi bu egbe gburu ụkọchụkwu abụọ na mmadụ iri na isi na Benue. Mana Buhari na-arịọ ndịdị, o kwukwara na ogbugbu mmadu na-eme ugbua na Naijiria ga akwụsị kpam kpam. Ikpe sinetọ Peter Nwaoboshi ka dị kwa Ụlọikpe dị na Lagos enyeela Sinetọ Peter Nwaoboshi ụbọchị abụọ ị wepụta mmadụ abụọ ga-akwụrụ dịka onye akaebe ya ma kwụọ ụgwụọ ruru nde iri ise tupu ha tọhapụ ya na mkpọrọ. Cheta na Nwaoboshi na-aza ajụjụ gbasara mpu na aghụghọ n'aka ndị EFCC maka ego ruru nde naira narị atọ, iri abụọ na abụọ. Nọt na Saut Korea enweela nkwekọrịta Ndị na-achị Nọt na Saut Korea enweela nkwekọrịta na ha ga-ewepu ogbunigwe nuklear niile dị n'ala ha kpam kpam. Ha kwuru ihe a n'ọgbakọ Kim Jong-un na Moon Jae-in nwere na Saut Korea taa. Iniesta ga-apuola na Barcelona N'egwuregwu, obi agbawaala ndị ụfọdụ ndị na-akwadọ otu Barcelona. Andres Iniesta ekwuola na ya ga-apụụ na Barcelona na ngwụcha afọ a. Andres dị afọ iri ato na atọ eruola afọ iri abuọ na Barcelona. Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyị taa Atiku: A ga m ekewa ikike ọchịchị gọọmentị etiti ma m bụrụ onyeisiala" afirika-54773997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54773997,Arthur Nzeribe: Ihe i kwesịrị ịma maka Ogbuagu Oguta,"A jụwa ajụjụ ala, ajụọ ewi, mana akọwa akụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti, a ga-akpọrịrị aha Francis Arthur Nzeribe.","Arthur Nzeribe Ọtụtụ ndị na-eto eto ugbua agaghị ama aha a bụ Arthur Nzeribe, maka na e lewe ihu agadi nwaanyị, ọ dị ka ejighi ego lụọ ya. Arthur Nzeribe bụ onye nọchitere anya mpaghara ọdịda anyanwụ Imo steeti n'ụlọ Sineti Naịjirịa malite n'afọ 1999 ruo 2007. A kpọọ aha ya taa, ụfọdụ ga-ama ọsụ, mana ụfọdụ kwa ga-asị na ọ bụ dike. Taa, bụ abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba 2020, ka Arthur Nzeribe gbara afọ iri asatọ na abụọ (82), Mana lee ihe kpatara ọtụtụ ji hụ ya n'anya ebe ndị ọzọ kpọrọ ya asị. Lee ihe mere ụfọdụ ji akpọ Arthur Nzeribe dike Arthur Nzeribe Etu esi hibe ebe a na-akpọ Ugwuta taa Ihe ụfọdụ ji kpọọ Arthur Nzeribe asị Arthur Nzeribe na Achike Udenwa (kpu okpu ọbara ọbara) aka chịburu imo steeti n'oge mbụ Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ralph Uwazuruike : Ihe ọ sara Nnamdi Kanu maka ngaghariwe End SARS" afirika-44079282,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079282,Ndị sineti chọrọ ime mkpesa maka ikpe sị ka e weghachite Omo-Agege,Ụlọikpe etiti n'Abuja ụnyaahụ kagburu nkwụsị ọrụ ndị sineti mere sinetọ Ovie Omo-Agege rue mkpụrụ ụbọchị 90.,"Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu Ọkaikpe kpebiri ikpe ahụ bụ Nnamdi Dimgba kwuru na ndị sineti enweghi ụdị ikike ahụ na ọ bụ naanị mkpụrụ ụbọchị 14 na otu ụbọchị nzụkọ ha ka ha nwere ikike ịkwụsị onye meọrọ ọrụ. Maka nke a, Ọkaikpe Dimgba nyere iwu ka a kpọghachi sinetọ Omo-Agege ozugbo ma kwụwa ya ego niile ruru ya. Mana nke a adabaghịrị ndị sineti dịka ha kwuru na ha ga-eme mkpesa maka ya bụ ikpe ma kwuo ka ikpe ahụ nọdụ etu ọ nọbụ. Cheta na a kwụsịrị sinetọ Omo-Agege ọrụ ụbọchị Epurel 12 maka okwu o kwuru oge ndị ntaakwụkọ na-agba ya ajụjụọnụ na mmegharị ndị omeiwu na-emegharị akwụkwọ iwu ntruliaka bụ iji megide onyeisiala Muhammadu Buhari. Nke a bụ agbanyeghi na ọ rịọbuola ndị sineti mgbaghara maka okwu ahụ o kwuru. Mana ndị kọmiti sineti na-ahụ maka ịdọ aka na ntị dere akwụkwọ ma kwuo ka a kwụsị Omo-Agege ọrụ ụbọchị 181 nzụkọ ndị sineti mana onyeisi sineto bụ Bukola Saraki kwuru ka e wetuo ya ụbọchị 90. Ụlọ sineti chere na Omo-Agege chịpụara ha ụkwụ na-ama site n'ịga n'ụlọikpe Gịnị ka ndị kọmiti ahụ kwuru? Oge kọmiti ahụ na-egosipụta akwụkwọ ha degara sineti, onyeisi habụ sinetọ Sam Anyanwu kwuru na kọmiti ahụ ekwenyeghi na mgbaghara Omo-Agege rịọrọ maka na o mechara kpụpụ ndị sineti n'ụlọikpe. Mana Omo-Agege na sintọ itoolu ndị ọzọboro ndị sineto ebubo na ha kpachara anya nabata mmegharị iwu gbasara ntuliaka. O kwuru na mmegharị ahụ bụ naanị iji megbute onyeisiala Muhammadu Buhari. Etu Omo-Agege si nabata nkwụsị n'ọrụ ya Cheta na a na-ekwu na ọ bụ maka na obi adịghị sinetọ Omo-Agege mma maka nkwụsị n'ọrụ ahụ ndị sinetị kwụsịrị ya mere o ji kpọrọ ndị omekome wakpoo ụlọ omeiwu n'ọnwa gara aga. Mwakpo ahụ mere e ji zuru ọfọ sineti rue otu ụbọchị mana ndị sineti jiri ọfọ ọzọ wee mee ọkpakọ ụbọchị ahụ. Onyeisi sineti kpọrọ ya bụ akparamagwa dịka nke megidere ala Naịjirịa ma bụrụkwa mbọ ịkwatu otu ngalaba ọchịchị Naịjirịa. Ọ bụrụ na ikpe maa onye mere ụdị ihe a, e nwereike ịtụ ya nga mkpụrụọka maọbụ gbuo ya. Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye-kwuo-uche-ya Gịnị ka mmegharị iwu ahụ kwuru? Iwu ahụ ndị sineti chọrọ imegharị na-ahazigharị usoro ntuliaka na-abịa n'afọ 2019. Ndị sineti chọrọ ka ntuliaka nke onyeisiala buru ụzọ bịa tupu e mee nke ndị ụlọomeiwu niile. Mana oge ha wegara onyeisiala akwụkwọ iwu ahụ ka o binye aka, onyeisiala jụrụ ibinye ya aka n'ihi na ọ na-anapụ ndị Inec ikike ime ntuliaka etu ha si chọọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47656331,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47656331,Rerun elections: Atiku etiele mkpu maka ọgbaghara dị na mmejuputa ntuliaka,"Ọ na-ede jimjim na Kano, Plateau,Sokoto ebe tigbo zogbo sochiri mmeju ntulika emere nke gọvanọ na ụlọomeiwe taa bụ satọde.","Atiku ebee maka mmejuputa ntuliaka Onye ji ọkọrọtọ PDP bụ Atiku Abubakar ekwuola n'akara Twitter ya na ọgbaagha aghọla njirimara ya bụ mmeju ntụtilaka ebe atụrụ anya na Inec kwesiri itofe nke a ugbua. Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe Juliet Kaego na ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe n'Ogbete Enugwu N'Enugwu taa otu ụmụnwaanyị kwụrụ onwe nka nke Juliet Kaego kpokobara emela ngagharị iwe na ụzọ ma na ahịa. Ụmụnwaanyị a dọrọ aka na ntị ma na-egosi iwe ha maka ịdọaka na mkparị ụmụnwoke na-enyaha n'ime ahịa ma ka ga-ịzụta ihe. Emeriela Isis na Syria Ndi agha nụrụ agha na Syria N'ofesi, ndị otu busoro ISIS agha na Syria ekwuputala na oge ndị omekataraihepụụjọ akpọrọ Islamic State agaala na Syria. Dịka ndị otu a kpọrọ onwe ha Syrian Democratic Force na-efegharị ọkọrọtọ ha na Baghuz bụ ọnọdụ ikpeazụ ndị Isis ha dọkwara aka na ntị na ndị otu ọjọọ a ka ga na-akpakwa mkpamkpa na mba ụwa. Jose Mouriho ga-amalite ọrụ na Jun Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England Onye nkuzi egwuruegwu bọọlụ dooro anya bụ Jose Mourinho ekwuola na mgbe adịghị anya na ya ga-amalite ọrụ na otu otu egwu bọọlụ. Mourinho sị na otu anọ akpọọla ya maka ịmalite ọrụ na June na ya ga ahọrọ otu malite mewe ihe ejiri mara ya. Gee nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ime akwụkwọ ozi ha zigara BBC Igbo ha kwuru na ha nụrụ akụkọ nrụrụaka si na ntuliaka pụta. Ha kwuru na ha nụrụ okwu mwakpo n'ebe dị icheiche ma zịgara ezinaụlọ ebe ndị mmadụ nwụrụ ozi itiakanobi. ""Dịka enyi mba Naịjirịa anyị bụ, anyị ga-akwado ọchịchị onyekwuoucheya nke ga-egosi uche ndị Naịjirịa"" ka ha kwukwara. Ozi ahụ dụrụ ndị niile ndọrọndọrọ ọchịchị gbasara ndụmọdụ si ha gbakọ aka mee ka ntuliaka ọbụla emere na Naịjirịa bụrụ nke ziri ezi. N'otu aka ahụ Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015 Ngalaba Inec eweputala ụbọchị ọhụrụ a ga-eji gụkọ vootu ndị a tụrụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Rivas steeti. Ụbọchị ha sepụtara bụ site n'ụbọchị 2 rue ụbọchị 5 nke ọnwa Eprelu. Ha kwụsịrị ngụkọ ahụ n'ike n'ụbọchị 9 nke Maachị maka okwu mwakpo na-arị ibe ya elu. Google a ga-emechi akara ozi ha? Akụko na-ekwu na ndị odogwu na Teknụzụ bụ Google nwereike ịmachi ndị mmadụ iji akara igbe ozi ha bụ ""Gmail app"" na Bekee. Ọ bidoro dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ha hụrụ ozi n'ekwentị ha na-agwa ha na ọ ga-apụ n'ụbọchị. Na mba Briten, Theresa May Webusait ndị mba UK adapịala ebe ndị mmadụ karịrị puku nari ise dakwasiri ya iji binye aka n'akwụkwọ ga-atụgharị Brexit. Cheta na mba Briten nọ na jebe ejebe naba anaba gbasara okwu i si n'ọgbakọ mba Yurop sere isi ha. N'egwuregwu, Ndị mmadụ na-aṅụrị n'elu soshal midia ọ kachasị Twitter maka akara AS Roma malitere n'asụsụ pijin. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-54109799,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54109799,Gịnị na-esere ndị Ipob na ndị Afara-Ukwu? Lee ihe anyị ma,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna ekwuola na ndị uweojii amaghị maka akukọ na-efegharị na soshal midia banyere obodo Afara-Ukwu na ọgbaghara metụtara ezinaụlọ Nnamdị Kanụ.,"Gịnị na-esere ndị Ipob na ndỊ Afara-Ukwu? BBC kpọrọ Maazị Ogbonna ịmata etu obodo ahụ si kwụrụ dịka ihe onyonyo pụtara na Facebook ụbọchị Satọde nakwa Sọnde rụtụrụ aka na nsogbu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị dara n'etiti Emmanuel Kanu bụ nwanne onyeisi otu a kpọrọ Indegineous People of Biafra (Ipob) na ụfọdụ ndị obodo ha bụ Afara-Ukwu. N'agbanyeghị ihe ndị uweojii kwuru, Eze Okwulehie bụ onye eji Eze Afara mara, gwara BBC na ọgbaghara dara n'obodo Esiama Afara Ukwu ụbọchị Satọde nakwa Sọnde dịka Emmanuel Kanu batara obodo ahụ malite iyi ndị mmadụ egwu. Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia na-arụtụ aka na ụfọdụ ọgbaghara a mere, mana ha egosighị ebe Kanu mere ihe ọbụla maọbụ wakpoo onye ọbụla. Ihe onyonyo ""Facebook Live"" Eze Okwulehie tinyere n'akara na Facebook dị ka o gosiri ebe ụfọdụ ndị Afaraukwu na-eme ngaghari iwe maka okwu ha na ndị ha kpọrọ aha dị ka ""Ipob"". BBC kpọrọ Maazị Kanu ịmata ihe ọ ma banyere okwu ahụ na ebubo a na-ebo ya, mana ọ sị na o nweghị ihe na-eme, ma kwukwa na ya nọ n'obi nna ya n'oge ahụ a kpọrọ ya. Mbọ niile BBC gbara ime ka o tinye ọnụ n'ebubo Eze Okwulehie boro ya amịtaghị mkpụrụ karịa ya ikwu na o nweghị ihe ya bụ okwu bụ karịa ""asịrị"". Ọ sị: ""Ya bụrụ na mmadụ kpọrọ unu kọọrọ unu asịrị, amaghị m maka ya. Sịnụ onye ahụ ya kwuo ihe ọ ma."" Eze Okwulehie na onwe ya gwara BBC na ọ bụ ụmụnna anọ nọ n'Eziama Afara, nke pụtara na ha anọ nwere ikike ịhọpụta onye ga-abụ onyeisi oche nke ha. 'Ha ji Ipob eyi anyị egwu' Nnamdi Kanu: ""Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a"" - Ezinaụlọ na agbatobi ya ""Ihe mere bụ na ya bụrụ na ị bụghị onye Ipob, Emmanuel Kanu agaghị ekwe ka ị nọdụ n'ọkwa."" Okwulehie sị na nsogbu bụ na ""onye ọbụla agaghị esorịrị n'otu Ipob"". Ọ sịkwa: ""Ihe anyị bịara bụ etu anyị ga-esi dozie obodo anyị, ọ bụghị ihe Ipob."" 'Okwu Python Dance' Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Okwu a na-abịa dịka o mere afọ atọ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ji ngwa agha gaa obodo Afara-Ukwu nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ a na-eche na ha bụ ndị Ipob. Nnamdi Kanu pụtara kwuo na ọ bụ mmadụ 28 lara mmụọ n'ụbọchị ahụ site n'ihe ọ sị bụ ""mwakpo ndị agha Naịjirịa"". Ndị agha na onwe ha na-agọ na ha egbughi onye ọbụla. Ruo ugbua, ndị ọrụ nchekwa ka na-eme ngagharị na ya bụ obodo kwa mgbe kwa mgbe. Dịka Okwulehie siri kọwaara BBC, ọ sị na nsogbu ha na Emmanuel Kanu malitere ""kemgbe ndị agha bịachara Egwu Eke were gbuchaa ndị mmadụ n'Afara-Ukwu"". ""Ka ihe ahụ mechara, ndị okorobia mere nzukọ sị na ha achọghịzị ndị ha amaghị ịbata Afara-Ukwu. Anyị hụ onye ọbụla, anyị ajụwa ya ebe o si bịa. Obere oge, ị chọpụta na ọ bụ be ha ka ha bịara."" Okwulehie sị na ngagharị a ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-eme bụ ịhụ na ndị ha amaghị abataghị n'obodo ahụ. ""Ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme bụ ịhụ na o nweghị nsogbu ọbụla dị, nakwa na o nweghi onye e merụrụ ahụ. Ị ga-eru Afara ị hụ ndị ị maghị ihu ha. Ị hụ ndị na-akpagharị. Anyị na-ekwu maka ndị a, na-achọ ịma ebe ha si, nwanne Nnamdi kanu akpọrọ ha na-agagharị na-achọ onye ha ga-eti ihe."" Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche" 42918562,https://www.bbc.com/igbo/42918562,Ndị mbịa mbịa: Ọtụtụ emiela mmiri na Libya,Ihe ruru mmadụ iri itoolu bụ ndị mbịa mbịa emiela mmiri ka otu ụgbọ mmirikpuru na mmiri dị na Libya dịka UN siri kwuo.,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ isi Liya gafe mpaghara Europe mana ọnụọgụgụ ha adaala. Mmadụ atọ ndị agbapụtara kwuru na ndị nwụrụ hinne bụ ndị mba Pakistan. Libya abụrụla ụzọ ndị mbịmbịa na-esi agba mbọ iji rue mpaghara Yurope site na mmiri. Mana n'afọ gara aga, otu EU kwekọrịtara na ha ga-enyere ndị nche na mmiri Libya aka ịkwụsị ụgbọ ndị bụ ndị mbịambịa nakwa ndị na-agbaga mba Italy. Ndị na-enye aka nakwa otu UN ebola ndị gọọmenti EU na ha anaghị eme nkeọma. ""Ozu mmadụ iri ka mmiri buputara n'akụkụ mmiri"" dịka otu na-ahụ maka ndị mbịambịa bụ International Organisation for Migration (IOM) Ọtu onye ọnụ na-erụ n'okwu kwuru na ndị mba Pakistan na-agbalịsiike ime njem ahụ. Ụfọdụ akụkọ gbasara njem na-ekwesighi ekwesi a na-eme na mba Libya pụtara n'afọ 2017 nke butere mba ụwa jiri tinye ọnụ na ya bụ okwu. Akpọghachitala ọtụtụ ndị njem ahụ bụ ndị Naịjirịa." afirika-43722096,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43722096,"Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392","Kọmishọna ndị uweojii na Legos bụ Edgal Imohimi kwuru na e nwere ijiegbeezu 1315, mwakpo ndị otu nzuzo 359, nakwa ntọ 392 na steeti ahụ n'afọ anọ.","Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu Imohimi, onye kwupụtara nke a na ọgbakọ nchekwa nke Legos steeti nke e mere na Legos kwuru na a nwụchiri ọtụtụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome, ebe ikpe ha ikpe ka na-aga n'ihu. O kwuru na ndị uwe ojii belatara ike ndị otu nzuzo a kpọrọ 'badoo,' akpa na mpaghara Ikorodu nakwa ndị isiekewọnwụ n'obodo dị na ikpere mmiri na steeti. O kwuru na ọ bụ nkwado ngwa ọrụ sitere na enyemaka nke gọọmentị Legos steeti mere ka ndị uwe ojii nwelie ike ime nke a. O kwukwara site na enyemaka ndị nchekwa obodo na njikọaka o hibere kemgbe ọ malitere ọrụ na steeti ahụ. Ọ kpọrọ oku ka agawanye n'ihu inwe ọrụ nchekwa gbanyere ụkwụ na nchọpụta nakwa enyemaka ndị eze ọdịnala nakwwa ọzụzụ ndị ọrụ nchekwa ka ọrụ ha were na-aga siririwerere. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43519236,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43519236,Ndị uweojii egbuola onye merụrụ mmadụ 16 ahụ na France,Egbuola Redouane Lakdim bụ nwoke ahụ echere na o bu egbe gbukwa mmadụ atọ n'ime ndị o jichiri n'ime ụlọahịa na mba France.,"Lakdim merụrụ mmadụ 16 ahụ n'ọnụ ọgụgụ Onyeisiala mba France Emmanuel Macron kwuru na ndị mmadụ ruru 16 merụrụ ahụ na mwakpo nwoke ahụ mere. Akụkọ si na ọ bidoro mwakpo a n'obodo a na-akpọ Carcassonne ebe ọ wakporo otu nwoke, zuru ụgbọala ya ma gbue ya. Ọ gbakwara otu onye uweojii egbe ebe ya na ndịwerojii ibe ya na-eme egwuregwu ọsọ n'obodo ahụ tupu ọ gaa Trèbes ga wakpo ụlọahịa dị ebe ahụ. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ bara n'ime ahịa akpọrọ ''Supermarket'' na bekee ebe ndị mmadụ na-azụ ahịa jichie ha ma gbuo mmadụ atọ. Echere na nwoke ahụ, bụ onye si mba Morocco sị na ọ kwụnyere otu ndị na eyi ndụ egwu akpọrọ Islamic State Group. Nwoke ahụ bu egbe dị icheiche ma na-achọ ka a tọghapụ Salah Abdesalam, otu onye n'ime ndị gburu mmadụ na mwakpo mere na France n'afọ 2015. Akụkọ kwuru na ọ bụ onye ndị na-ahụ maka nchekwa na mba France ma ama, a sị kwa na nne ya nọ n'ebe ihe a mere. Onyeisiala mba France akpọọla ihe a mere ""mwakpo na-eyi ndụ egwu ndị alakoba"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44755785,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755785,United Nations: Azụ ga-agwu na mmiri,"N'akwụkwọ United Nations depụtara n'ụbochị Julaị 9, ha dọrọ ụwa aka na ntị gbasara ụkọ azụ na-abịa n'ihu.","Azụ bụkarị nrị na-edozi ahụ ọtụtụ mmadụ nọ n'akụkụ ụwa dị iche iche UN kwuru na ụkọ azụ ga-adị makana ọtụtụ mmadụ na-akụgbu azụ n'osimiri dị iche iche n'obodo ha nke kpatara na ya bụ azu ha jiri mere ihe ndozi ahụ agaghị erutenwukwa ha aka n'ọdịnihu. Otu a kpọrọ ''Food and Agriculture Organisation'' (FAO) kwuru na nkụgbu azụ a na-emekarỊ n'obodo ka na-emepe emepe ebe ndị mmadụ na-agba mbọ inweta ezigbo nri na-edozi ahụ. O kwukwara na ịkụ azụ ga-eji ihe ruru pasentị iri na asatọ rịa elu mgbe o ruru afọ 2030. Azụ friji na-amasị ndị Naịjirịa ugbua ebe echere na ọ bụbu nri ndị ogbenye. Akwụkwọ a FAO depụtara kwuru na ịkụ azụ ejila pasentị iri rịa elu kemgbe afọ iri anọ gara aga. Ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si-eri azụ 1. Azụ na akwụkwọ nri. Azụ bụ nri na-adị mma iri ma ọ bụrụ na ị na-achọ ịta ahụ. 2. Ji mmiri ọkụ na azụ. Ji mmiri ọkụ bụ nri na-adị nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ mma n'ahụ. Ọ na-atọ ụtọ pụrụiche ma e tinyekwa azụ n'ime ya. 3. Ji na stew azụ Nrị nke a na-amasị ụmụ akwụkwọ karịchaa n'ihi na ọnaghị egbu oge maọbụ ewe nnukwu ego iji sie ya. Ọ na-amasịkwa ụfọdụ mmadụ na mpaghara Afrịka niile. 4. Azụ a mịrị amị Nke a na-amasị ndị na-apụ ọrịrị, maka na ha na-ejikarị mmanya jụrụ oyi nakwa ihe Bekee kpọrọ 'salad' ata ya. 5. Abacha na azụ A gaghị akọwa akụkọ abacha ghara ịkpọta azụ aha. Ha abụọ na-agakọ ọnụ ka anwụ na ọnwa, maka na ọ bụ ihe e ji atagharị ọnụ ma ị na-ata abacha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53349842,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53349842,Ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Joy Nunieh na Pọtakọt,"Ndi ọrụ nchekwa awakpoola ụlọ Joy Nunieh, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ NDDC dị n' Owuru Creekview, dị na Pọtakọt n'ụtụtụ taa bụ Tọzde.","Joy Nunieh bụbu onyeisi NDDC n-arụ Godwill Akpabio aka n'ebubo nrụrụaka ruru ijeri Naira iri anọ(N40bn) Nunieh na Godwill Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta Ministry kwesịrị ịpụta n'ihu kọmiti Ụlọomeiwu Ukwu taa bịa zara ọnụ ya n'ebubo mmefu e mefuru ijeri naira iri anọ (N40bn) ego ndị isi chere ka abịa lekọtaraburu NDDC. Mana ndị uweojii ụfọdụ bu ebe jiri uwe ha, ebe ndị ọzọ ji akwa nkiti wujuru n'ụlọ ya n'ụzọ ụtụtụ Tọzde. Dịka nchọpụta BBC mere, Nunie bekuru gọvanọ Rịvas steeti bụ Nyesom Wike, onye ji ụgbọala ya bịa kwọrọ ya gaa n'obi Gọọmenti Rịvas. Cheta na abalị ole na ole gara aga, Gọvanọ Wike wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ nọrọ kwuo na mmiri agaghị abakwa Nunieh ntị n'ihi na ọ bụ ada Rịvas. Nke a na-eme dịka Akpabio na Nunieh na-adọrịta ụka ihe mere ijeri naira iri anọ ego NDDC a maghị ka e si mefuo. Akpabio na-ekwu na ya amaghị ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ n'ihhi na Nunieh ekweghị na-iwetara ya ozi banyere ka o si aga, , ebe Nunieh na-ekwu na ọ bụ Akpabio kpara nkata ka a napụ ya ọrụ n'ihi na ya ekweghị ka emefuo ego na ụlọrụ ahụ. Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Omoni Nnamdi, ọ kwuru na ya amaghị maka ya. ""Aga m akpọ DPO mpaghara ahụ iji mata n'ihe ahụ emere n'ezie."" Joy Nunieh ọ kụwara akịoyibo nsugbe NDDC? Joy Nunieh bụbu onyeisi ndị a họpụtara ka ha lekọta ngalaba na-ahụ maka ọdịmma mpaghara Naịja Delta nke Bekee kpọrọ 'Niger Delta Development Commission' (NDDC), na-ebo Minista na-ahụ maka mpaghara ahụ bụ Godswill Akpabio ebubo nrụrụka nakwa ịchọ idina ya. Nunieh, n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, boro Akpabio ebubo na ọ nọ na-amanye ya ka ọ ṅụọ iyi ga-eme ka ọ ghara ịgba ama nrụrụaka e mere n'ime ọnwa anọ ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi NDDC. Maazị Akpabio n'onwe ya gara ụlọ ntaakụkọ Arise ga kwuo na ihe Nunieh na-ekwu bụ okpotokpo asị. O boro Nunieh ebubo na onweghi asambodo na-egosi na o fere Naịjirịa otu afọ nke a kpọrọ ""National Youth Service Corps"" (NYSC). Akpabio sị na ọ bụ ihe a mere eji chụọ Nunieh n'ọrụ. Ka a ka na-eche na okwu ajụọla oyi, Nunieh kwuru nke tọrọ ibe ya oge ọ gara Arise ga sị na iwe Akpabio bụ na ọ gbajọrọ mmekọrịta nwoke na nwannyị ọ rịọrịọ ya. Ebubo mmadụ abụọ a na-awụsa n'isi onwe ha tụrụ ndị mmadu n'anya, nke mere ka ụfọdụ na-asi ka Minista Akpabio rituo n'ọkwa. Kedụ ebe okwu a malitere? Dịka akụkọ siri kwụrụ, okwu dị n'etiti mmadụ abụọ a malitere oge Akpabio chụrụ Nunieh n'ọrụ n'ọnwa Febụwarị nke 2020. Onyeisiala Muhammadụ Buhari mechara họrọ Kemebradikumo Pondei, onye ọkammụta n'ihe banyere ahụike, ka ọ nọchie anya odoziakụ Nunieh. Akpabio sị na ọ bụ maka nnyocha ha na-eme kpatara ude NDDC ji ede ugbua. Ọ sị na kemgbe ehibere ngalaba a, ọ bụ sọsọ mpụ na nrụrụaka na-aga n'ihu n'ime ya. ""A ma m na a ga-ebuso m agha maka mkpocha m chọrọ ime na ngalaba ahụ,"" Akpabio kwuru. Joy Nunieh na onwe ya sị na nke ahụ bụ asị. ""Ihe Akpabio bịara ịgwa ndị ụwa bụ ihe banyere di ole m lụrụ. Ọ ga-abịa agwa ụwa ndi bụ di anọ m lụrụ nakwa ihe mere o ji bụrụ ụdịrị ihe a ka ọ chọrọ ikwu maka ya."" Ọ sịkwa na ọ bụ asị na ya enweghị asambodo. ""Ihe mere bụ na-enweghị m nke enyere m, makana o furu. E dere m akwụkwọ ka ma jiri nwete ọzọ."" Nunieh na-akọwa na onweghi ikpe ọbụla mara ya nke a ga-eji sị na ya metara ihe a ga-eji chụọ ya n'ọrụ. Okwu butere okwu Godswill Obot Akpabio sí na Nunieh aluọla di anọ bụ ndị ọ sị ka ajụọ maka agwa ya Ndị na-arụ ọrụ na ndị rụbụrụ ọrụ na NDDC na-ebo onwe ha ebubo nrụrụaka kemgbe Onyeisiala Buhari sị ka e nyochaa etu esi emefu ego na ngalaba ahụ n'afọ 2020. N'ụbọchị ise nke ọnwa Mee, ndị omeiwu Naịjirịa hibere kọmịtii mmadụ ise ga-enyocha ""mmefu ego aghara aghara"" nke ndị ehibere ka ha chia NDDC a kpọrọ ""Interim Management Committee"" (IMC). Ndi omeiwu na-akọwa na ngalaba NDDC emefuola ihe karịrị ijeri naịra iri anọ n'esoghi ụzọ ziri ezi. Mana, ndị na-achị NDDC si na ọ bụ ndị achọghị ka e nyochaa NDDC kpatara atụmatụ a ndị omeiwu wepụtara. NDDC na onwe ha na-ebo onyeisi oche Kọmitii na-ahụ maka Naịja Delta na NDDC bụ Peter Nwaoboshi ebubo na aka ya dị na nrụrụaka ijieri naịra atọ na ụma isii. Maazị Nwaoboshi sị na aka ya adịghị ya ma kwukwaa na ha amaghị ụlọọrụ ndị a kpọrọ aha banyere nrụrụaka a. N'otu aka ahụ Nunieh na-akọwa na Akpabio binyere aka n'ego niile ha mefuru na NDDC. Nke bụ eziokwu bu na ahụbeghị azu okwu a." afirika-47457248,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47457248,Election 2019: Ihe m ga-eji garịrị ụlọikpe - Peter Obi,"Agbanyeghị na ndị mmadụ arịọla ya ka ọ ghara ịga ụlọikpe gbasara mpụtara ntuliaka nke ọkwa onyeisiala emere n'ọnwa Februwarị iri abụọ na atọ, Peter Obi agbala isi akwara.","Peter Obi kwuru na ọ ka kwenyere siri ike n'ulọikpe Naịjirịa O kwuru na ọ ka nwere ezigbo okwukwe n'ụlọikpe Naịjirịa n'ihi na mkpesa ha n'ụlọikpe ga-eme ka ihe ọjọọ niile o kwuru mere n'oge ntụliaka nke ọkwa onyeisiala hapụ ịla na nta. Mgbe Obi na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na be ya dị n'Onitsha, o bunyere ụmụ Naịjirịa ụkpa ekele etu ha si pụta n'uju ịtụ ntuliaka ọkwa onyeisiala emerela. Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ ntuliaka akwụghị ọtọ maọlị makana enwere ọtụtụ nwakpo, ogbugbu nakwa igwe ""card reader"" na-arụghị ọrụ n'ụbọchị ahụ. Obi kwuru na nke a tinyere ụjọ na ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na ndị ndịda anyanwụ ma na-ekwu na onweghị nrụrụaka ka nke a. Ọ katọrọ etu ndị nọ na ọchịchị si wakpo ndị nọ na pati PDP ma ndị na-atụnyere ha vootu ma na-arịọ ka ndị mmadụ pụta n'uju tụọ vootu na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-47408744,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47408744,The Resurrection Challenge: Amụma isii wuru ewu na soshal midia,Ọ bụ mgbe ụfọdụ ụlọozu na mba Saụt Afrịka kpebiri ịkpụpụ otu ụkọchukwu bụ Alph Lukau ụlọikpe maka aghụghọ ka okwu bidoro.,"Ha kwuru na Lukau ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye n'aghụghọ ịkpọlite mmadụ n'ọnwụ. End of Twitter post, 1 Nke a mere ka anyị họpụta amụma ndị ọzọ bụ ihe ịtụ anya mere na mpaghara Afrịka. 1. Ụkọchukwu na-amị ara ụmụnwaayị iji zọpụta ha. Otu ụkọchukwu kpọrọ onwe ya ""Chijioke"" gara kpọghe ụlọụka na mba Kenya. O malitere iwu mgbe ọ gwara ụmụnwaanyị ha bịa n'ụlọụka ya ka ọ mịa ha ara iji mịpụta mmụọ ọjọọ dị n'ime ha. Gee ihe ọ gwara onye ntaakụkọ n'uju mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ. 2. Onye gwara ndị nso ya loo agwọ Penuel Mnuguni gwara ndị nso ya ha loo agwọ iji kwado ebe akwụkwọ nsọ kwuru na ""ị ga-ejiri ọkpa gị zogbuo akpị na agwo mana o nweghi ihe ga-emetụta gị"" 3. Onye gbara ndị nso ya ọgwụ anwụ Letheboo Rabalago malitere iwu mgbe akụkọ pụtara na ọ na-agba ndị ụlọụka ya ọgwụ anwụ iji gwọ ọrịa nje HIV nakwa ọrịa kansa. Ụkọchukwu ahụ na mba Saụt Afrịka mechara gaa ụlọ mkpọrọ maka ịda iwu imerụ mmadụ ahụ. 4. ""Taanụ ahịhịa iji bịa Chineke nso"" N'otu Saut Afrịka ahụ kwa, Lesego Daniel gwara ndị nso ya ha pụọ n'ọhịa gaa taa ahịhịa dịka anụmanụ. O kwuru na nke a ga-eme ka ha bịa Chineke nso. 5. Onye gara eluigwe ya na Chukwu 'esee foto' Otu ụkọchukwu a kpọrọ Mbhoro gwara ndị nso ya na ọ gara eluigwe ị ga mmemme, ya na Chineke were see foto. O bidokwara ịresi ndị otu ya foto ya na Chineke sere n'eluigwe. 6. Ụkọchukwu Ghana kwuru na ya ahụtụla Adam na Eve Ụkọchukwu, ụka 'International Gods Way Church' , Ghana ama ama bụ Daniel Obinim na-ewu ewu maka ihe 'nrịbaama' dị iche iche ọ na eme. Ihe ndị a gụnyere ime ka nwoke ihe nwoke jiri buru nwoke mere mpe buwa ya ibu site na ịhịọ ya aka. Ọzọ, Obinim kwuru na ya ejiri la anya ya hụ Adam na Eve. Obirin anwalela ifega eluigwe mana ndị ụka ya gbochiri ya. A makwa Daniel dịka ụkọchụkwu na-'achụ ajọ mụọ' n'ụzọ na-atụ na anya . A makwa Obinim maka inye ndị mmadụ akara ha ji nwe nrite na ịgba chacha." afirika-56895498,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56895498,Insecurity in South-East: Lee ebe niile e nwere mwakpo n'ala Naịjirịa kemgbe izu a,Ndị o ji egbe wakporo isiụlọọrụ ndị uweojii bụ Divisional Police Headquarter dị na Nkporo n'Okpuru Ọchịchị Ohaji n' Abia steeti.,"Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ mwakpokama a gbara ọgbatutu ndị uweojii nakwa ihe ụfọdụ ọkụ. N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ndị uweojii gbochiri na ihe e mebighị dịka ndị mere mwakpo ahụ siri kwado. Ọ sịrị, ""Ha tụrụ ogbunigwe n nke mebiri oche. Ha gbakwara ọgbatumtum nndị uweojii dị n'iro, kụwasịa ugegbe ụgbọala ndị uweojii ma zuru ọgbatumtum abụọ bụ ihe akaaebe ndị mmadụ ndị uweojii jichiri."" Ogbonna, onye kwuru na o nweghị onye nwụrụ na mwakpo ahụ kwuru na ha amalitela nnyocha iji mata ihe mere n'uju. Umahi amachiela ngagharị dịka e gburu ndịagha abụọ, ndị ọzọ n'Ebonyi steeti Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahii amachiela ngagharị na Steeti ahụ malite n'Elekere Asatọ nke abalị rue Elekere isii nke ụtụtụ dịka e gburu ndịagha abụọ,otu onye uweojii, otu onye nkịtị ebe egbe tụrụ onyeisi ụlọakụ n'ụkwụ dịka mpiti kwere na steeti ahụ na ngwụcha izuụka. N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abaliliki Isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Wenezde oge ọ na-agwa ha ihe ha jetara n'ọgbakọ nchekwa ha nwere, Umahi sị: `Anyị enyeela iwu ka ịmụanya abalị niile kwụsị n'Elekere isii nke mgbede. Ndị ọrụ okpuruọchịchị, Ebubeagụ nakwa ndị Ọrụ nchekwa ga-ahụ na-agbaso iwu a. Onye ọbụla dara ya bụ mmachị ga-akwụ otu nde naira."" Umahi boro ndị obodo Agila dị na Benue steeti ebubo na aka ha dị na mkpamkpa ahụ kpara na Mgbo dị n'Okpuru Ọchịchị Ohaukwu dị na steeti. Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti O sịrị na ndị Agila na-akwụ ndị Fulani ụgwọ ka ha bata na steeti ahụ na-ezu ohi ma na-egbusịsị mmadụ ma na-ebo ya ndị otu Ipob na ESN. ""Anyị ma maka ọgbụgbụ e gburu otu onye uweojii, ndị agha abụọ, otu onye nkịtị na ngwụcha izuụka."" Ndị ekperima gbuchaa ha tinye ya na sochal midia si na ọ bụ ndị Ipob na ESN, ma Ipob na ESN na-agọ na aka ha dịghị ya."" Umahi onye jụrụ ajụjụ ma ịgba mbọ nnwereonwe ọ pụtara igbusisi ndị aka ha dị ọcha kwuru sị, "" Ihe m ma bụ na mpụ bụ mpụ, enyela m ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha kpochapụ mpụ niile na steeti a."" O gara n'ihu kwu na ndị niile aka ha dị n'ogbugbu ndịagha na ndị uweojii na ha ga-azara ọnụ ha n'ihu iwu. N'aka nke ọzọ, o nyere ndị dibia niile nọ na steeti abalị asaa ka ha denye aha ha n'aka gọọmentị steeti ahụ. Umahi nyekwara ndị na-agba ọkada iwu ka ha malite otu nche ga- na-ejide ndị ji ọkada eme mpụ, enmmeghị etu ahụ ya amachie ha na steeti ahụ. Lee ebe niile njinji jiri n'ala Naịjirịa kemgbe izu a Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Ụjọ na gbagharịa ji ụfodụ ọtụtụ mmadụ ugbua maka akụkọ metụtara ọnọdụ nchekwa obodo na-aakawanye njọ si na gburugburu Naịjirịa apụta. Ọtụtụ ha mere n'Ọwụwa anywanwụ ebe ndị ọzọ na-eme kwa ebe ọzọ n'ala Naịjirịa. Lezie ngụkọ akụkọ ndị ahụ bụ ndị BBC Igbo chọpụtara mere kemgbe izu a. N'Ebonyi steeti - Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị ugbua na-ekwu na awakpoola otu ụlọakụ dị n'ebe a na-akpọ Onueke n'okpuruọchịchị Ezza. Nke a mere n'ụbọchị 27 ọnwa Eprelu afọ 2021, otu onye uweojii nwụrụ ebe ndị mmadụ gbachiri ụlọahịa ha gbawa ọsọ ndụ. - Na nke yiri ya ke mekwara taa bụ Tuusde ụbọchị 27 nke ọnwa Eprelu 2021 bụ na a wakporo ụlọikpe etiti nke dị Abakaliki dị n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Tuzde. Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ kwuru na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ mwakpo. N'Anambara steeti Ndị a maghị ndị ha bụ gburu mmadụ itoolu n'Igbariam, Anambara steeti. Nke a mere ka ụmụakwụkwọ bi n'akụkụ ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ maka ụjọ mmegwara n'aka ndị Fulani. Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha na-enyocha ya bụ okwu mere n'ụtụtụ Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021. - Ndị omekome wakporo ndị uweojii na Kebbi steeti gbuo ndị uweojii asatọ nakwa ndị nche obodo abụọ. Nke a mere na Monde ubochi 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021. - Ndị ntọ egbuola mmadụ abụọ n'ime ụmụakwụkwọ Mahadum Greenfield atọọrọ na Kaduna. Achọtara ozu ha na mpaghara steeti ahụ na Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu dịka Gọvanọ steeti ahụ katọrọ ya bụ ihe mere, - Ndị ojiegbe bụ ""Unknown gunmen"" gburu ndị ọrụ nchekwa ruru itoolu na Rivas steeti dịka awakporo ogige ""check point"" ha. Nke a mere na mgbede ụbọchị ụka bụ 25 n'ọnnwa Eprelu afọ 2021 dịka akụkọ nchekwa na akawanye njọ. - Ndị agbero na ndị ọkada kwakọtara isi n'Iyana Iba dị na Legọs steeti. Nke a mere n'ụbọchị Monde 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021. - Ihe rụrụ mmadụ iri ise nwụrụ n'aka ndị ojiegbe akpọrọ ""unknown gunmen"" na steeti Rivas, Kebbi, Anambra, Borno, Ebonyi nakwa Imo steeti. Mwakpo ndị a niile mere na Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021. - Awakporo ụlọorụ ndị uweojii n'Okigwe Saụt dị n'Imo steeti n'abalị ụbọchị Monde 26 ọnwa Eprelu afọ 2021. Akụkọ pụtara bụ na ndị uweojii mmadụ ise nwụrụ na ya bụ mwakpo amabeghi ndị mere ya. - Ndị amaghị ndị ha bụ na-agbapụ egbe n'Amawusa nakwa Douglas Road. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na a na-akwa mgbọ abali niile rue ụtụtụ mana - Awakporo be Sunday Adeyemo a ama dịka ""Sunday Igboho"" n'Oyo steeti n'abalị ụbochị Sunde 25 ọnwa Eprelu afọ 2021. Ọnụ na-ekwuru ya bụ Dapo Salami gwara BBC na ụda egbe malitere n'etiti abalị ma rue ụtụtụ nakwa na amaghị ọnụọgụgụ ndị ahụ bịara ịwakpo ụlọ ya. - Ndị amaghị ndị ha bụ gbara ụlọ Igwe Ifitedunu ọkụ n'abalị ụbọchị Sunde. - Ndị agha elu mere mmehie gbagbuo ndị agha ibe ha n'ala dịka otu Boko Haram na-awakpo ha." afirika-46022629,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46022629,Oby Ezekwesili ekwuola na ya a Ipob ga-enwe mkparitaụka ma ọ chịwa Naịjirịa,"Onye na-azọ oche onyesiala n'okpuru pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) bụ Oby Ezekwesili ekwuola na ọ ga-akpọkete ndị otu niile na-agba isiakwara, gee ha nti ma mata ihe bụ iwe ha.","Ezekwesili katọrọ pati APC na PDP maka ndị ha weputara ịzọ oche onyeisiala Ezekwesili kwuru nke a n'ọgbakọ o kpokobara ịzị ndị ntakaụkọ ozi gbasara ndị che na ọgaghị emeri na ntuliaka na-abịanụ. O kwuru na ọ bụ ya bụ onye ga-achịnwụ Naịjirịa ugbua makana ndị otu pati PDP na APC agaghị emetanwụ ihe dị na ya. Ezekwesili kwuru na otu PDP na APC bụ otu pati nke ya ga-akpọ ""Butiku"" maka na ndị ha wepụtara ịzọ ọkwa onyeisiala bụ otu ihe n'agwa. Ọ gwara ndị ntorobia bịara ọgbakọ a ka ha ghara ịtụnyere ndị ga-eme ka ha nọrọ n'ahụhụ nakwa na oge eruola mgbe ha ga-eji kwuo na o zuola nke ikpeazu. Ezekwesili kwuru na ọ ga-ege ndị ọ na-enweghị ka ọha ha nti Ezekwesili kwuru na ọ ga-enye ndị na abụghị ndị ọrụ gọọmenti ohere ka ha wulite akụ na ụba Naịjirịa ma ọ banye oche onyeisiala na 2019 ruo ya aka. O jikwa ohere a kele ndị be Tony Anenih onye bụ bu onyeisi n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ PDP ma rịọ ka Chukwu kasie ha Obi. Ihe asatọ Ezekwesili kwuru na ọgbakọ mbasa ozi a Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-51641247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51641247,Ash Wednesday: Lee ka ụkantụ si aga,Taa bụ ụkantụ ndị ụka Kraịst n'ụwa niile.,"Ụkantụ n'Adamawa Onye buru ntụ n'Adamawa Ndị otu Kraịst na-egbu ntụ n'ihe iji chetere onwe ha na mmadụ bụ aja, mmadụ ga-alọhachị n'aja. Ndị ụka katọlik na Naịjirịa jikwa ohere a egosi iwe ha maka oke ogbugbu ndị mmadụ nakwa enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa. N'Adamawa, ndị ụka zakwara aha ha gosị na ha so n'ihe a na-eme. Na Legọsi, ndị ụka gosiri onwe ha tupu ha agawa ụlọọrụ. Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins N'Enugwu, ndị ụka Katọlik mere ngagharị ekpere ka a kachara ụka ntụ. Ndi ụka katọlịk nyekwara ntuzịaka ka onye ọbụla yiri ụweojii maọbụ kere akwa ojiri n'aka. Mana na ụka ha dị na Falomo, Legọs, ọ bụghị mmadụ niile yi ya bụ akwa ojii dịka ụka siri kwuo. Ọtụtụ ndị eyighị ya bụ akwa ojii sị na ha kwadoro maka ị ga ọrụ. Agbanyeghị, ọtụtụ yikwa akwa ojii. Ọtụtụ mmadụ juputara n'ụka Church of Assumption dị na Falomo, Legọs. Akụkọ ga-amasị gị Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'" afirika-48979750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48979750,Super Eagles Jersey: Gịnị jikọrọ uwe e ji agba bọọlụ na mmeri bọọlụ?,Okwu esila n'ihe ọ bụ banye ihe ọzọ dịka ndị mmadụ na-ekwu ihe ha chere mere ka ndị otu 'Super Eagles' ji rie bọọlụ ha na Algeria gbara ụnyahụ.,"Ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ maka na otu egwurewgu bọọlụ Algeria ka sie ike, ụfọdụ na-ebo ya uwe ndị 'Super Eagles' ji gbaa bọọlụ ahụ. Ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na mgbe ọ bụla ndị 'Super Eagles' yi uwe bọọlụ na-acha akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ(green), ha ga-adarịrị. @OsasWrite kwuru ka amachie ya bụ uwe bọọlụ 'Super Eagles. End of Twitter post, 1 @AlfFortune kwuru na a bụrụ ya bu uwe ọnụ. Mana ndị dịka ‏ @EuginhoCortez ekweteghị na ọ bụ uwe nwereike ime mmadụ ọ daa n'asọmpị. @samCodeNg kwuru na ụta adịghịri uwe a eji agba bọolụ mana ọ chọrọ ka akpọ ya ọkụ. Mana o nwekwala mgbe Naịjirịa yi uwe 'akwụkwọ ụgụ' merie? Naịjirịa yi ya bụ uwe merie Libya site n'inye ha ọkpụ goolu atọ asatara abụọ n'asọmpị ntozu AFCON nke 2019. Ha yikwa ya bụ uwe merie ndị otu egwu bọọlụ Egypt site n'inye ha otu gọọlụ asataghị asata n'asọmpị enyi na enyi ha gbara maka AFCON 2019 Lekwa ụfọdụ mgbe ha yi ya wee daa asọmpị Ha yi uwe 'green' a mgbe Madagascar piara ha ọkpụ goolu otu asataghị asata n'AFCON 2019. N'afọ 2018, Argentina meriri Naịjirịa n'asọmpị iko mbaụwa ebe Croatia chụpụrụ ha ajọ mmụọ n'asọmpị ahụ dịka ha yi uwe ahụ. South Africa piara ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu mgbe ha yi uwe 'green' a zute ha n'asọmpị ntozu nke AFCON 2017. Ọ dịkwazi ka mgbe ha yi uwe a wee daa egwuregwu ha karịrị mgbe ha ji ya wee nwe mmeri. Anyị ga-ajụta onye ọnụ na-eru n'okwu ka ha kọwara anyị. Akụkọ na-abia. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49608138,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49608138,Buhari na Umahi: Lekwa ihe dapụtara na nzụkọ Gọvanọ Umahi na Onyeisiala,Igbo na-atụ ilu na ozi e ziri anwụrụọkụ ga-eru eluigwe ntị.,"Nke a mere gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi jiri gbaruo Abụja ụbọchị Tọọzde maka ozi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu zipuru ya mgbe ha nwechara nzụkọ na Satọdee. Onyeisi ntaakụkọ Ụmahị bụ Emmanuel Uzo gwara BBC Igbo etu nzụkọ Umahị na Onyeisiala Muhammadu Buhari siri gaa. Lee ihe ndị ọ kwuru: Ihe gbasara mmachị ndị ọchị ehị: Gọvanọ Umahi kwuru na a chọzighị ndị ọchiehi igagharị n'ọwụwa anyanwu. Onyeisiala bụ Muhammadu Buharị kwetere na nke a dịka Gọvanọ Dave Umahi kọwara na ọbụ ndị ọchị ehi na-ebu egbe 'AK-47' si mba ọzọ dịka Niger, Chad na mba ndị ọzọ ka ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu machiri na ọbụghị ndi nke bị na ọwụwa anyanwụ kemgbe. Ọdọ Ugbọelu Akanu Ibiam nke Enugu Steeti: Emechiela ọdọ ụgbọelu maka iruzi ya Umahi kwuru maka akwụkwọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu degaara onyeisiala maka irụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam nke dị na Enugwu. Onyeisiala nabatara ya ma Umahi rịọkwara ya ka a gbatia ụzọ ugbọelu si efepu ka ọ nwee ike i nabata ụgbọelu ndị buru ibu. Irugharị okporo ụzọ esi abata ọwụwa anyanwụ : Etu ụzọ si Enugwu gawa Owerre dị Onyeisiala kwetere na arịrịọ Umahi rịọrọ maka idozi okporo ụzọ e si abata ọwụwa anyanwu ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ibata ma na-apụkwa. Iruzi ụgbọ oloko na ihe eji amị ikuku ""gas"" Gọvanọ Umahi rịokwara ka edozie igwe na-ebu ụgbọ oloko nke dị n'ọwụwa anyanwụ Umahi rịọkwara onyeisiala ka ọ tinye anya na iruzi igwe ụgbọoloko na-agba ma tinyekwa anya n'ihe gbasara igwe eji amipụta ""gas"" n'ọwụwa anyanwu. Ọ gwakwara Buhari na ọ ga amagbu onwe ya ma enwee ọgbakọ ebe ya na ndi gọvano na ndị ndụ ndị Igbo ndị ọzọ ga-akparịta ụka. N'Ikpeazụ Dịka Emma Uzo si gwa BBC, onyeisiala kwetere ihe niile Umahi rịọrọ ya. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri ga-amasi gị Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya" afirika-45076820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45076820,Ndi agha Naịjirịa zutere ndị ọchịehi na Benue tie ha mmanwụ,Ndị agha Naịjirịa ekwuola taa na ha zutere ụfọdụ ndị ọchịehi ji ọtụtụ ngwọagha n'okpuru ọchịchị Guma na Benue steet.,"Ndi agha ahụ kwuru na ndị agha nọ agha a kpọrọ ""Operation Whirl Stroke"" na Bekee bụ ndị zutere ndị ọchịehi ahụ kpo ọtụtụ ehi nakwa ọtụtụ ngwọagha. Ha dere n'akara twitter ha na ndị agha mekpara ha ahụ site na ngwọagha ka nke nke ha. End of Twitter post, 1 Ha kwuru na ndị ha agaghị agụtali ọnụ bụ ndị a na-atụ anya na ha gburu ebe ndị ọzọ wụbara n'ime ọhịa mana ha bu mgbọ egbe n'ahụ. Ha kwukwara na ha na-agba mbọ inweta ndị ahụ gbara ọsọ mana ha natara ọtụtụ ngwọagha n'aka ndị ha gburu. Ha kpọkwara oku ka onye ọbụla hụrụ ihe na-ekwesighi ekwesi maọbụ onye ọbụla bụ mgbọ egbe n'ahụ gaa kpee n'aka ndị ọrụ nchekwa nọ ha nso. BBC Igbo gbara mbọ ịnweta onye nkwuchiteọnụ ndị agha mana ha azaghị. Cheta na ndị ọchịehi awakpola ma gbuo ihe karịrị mmadụ otu puku na Benue, Taraba na Platu steeti n'afọ a 2018. Agha a kpọrọ 'Operationa Whirl Stroke"" na Bekee bụ nke ndị agha ji aluso ndị ọchịehi ọgụ na steeti anọ ndị ọchịehi na-akpa ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49654992,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49654992,Presidential election Tribunal: Buhari emeriela Atiku n'ikpe onye meriri ntuliaka 2019,Ụlọikpe akpụla akwụkwọ Atiku Abubakar gbara Buhari n'ụlọikpe pụrụ iche onye meriri na ntụlịaka onyeisiala Naijiria nke afọ 2019.,"Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke onye ndu ha bụ Jọstịs Mohammed Garba kwuru na akwụkwọ akaebe niile ndị gbara akwụkwọ wepụtara iji kwado ebubo ha boro dịka na atụụ vootu karịrị ndị tụrụ ya egosighị. Ụlọikpe ekpebikwara na Inec ejighi ""server"" gbakọọ mpụtara ntuliaka ahụ n'akwụkwọ Atiku Abubakar nke PDP gbara Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja ụbọchị Fraide. Ụlọikpe kwukwara na Osinbajo ejighi ' Tradermoni' zụọ vootu ndị mmadụ ma kwụkwaa na Buhari gụ®ụ aakwụkwọ tozuru ịbụ onyeisiala Onye fere ọkọlọtọ ""People's Democratic Party"" (PDP) bụ Atiku Abubakar na ntuliaka ahụ gbaburu Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ e mere n'abali 23 nke ọnwa Maachi. Atiku sị na ọ bụghị Buhari nwe mmeri na ya bụ ntuliaka. Dịka ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwupụtabu, Buhari nwetara vootu dị 15,191,847 nke pụtara pasenti 56, ebe Atiku nwetara vootu dị 11,262,978 nke pụtara pasenti 41 vootu a tụrụ. Mana Atiku wepụrụ okwu ahụ ụlọikpe pụrụiche e hiwere maka ntuliaka ịgbagha ya bụ mpụtara. Ihe atọ Atiku na PDP sị na ha chọrọ ka ụlọikpe kpebie Atiku na pati ya bụ PDP boro ebubo na ha nwere ihe akaebe gosiri na e mere wuruwuru dị egwu na ntuliaka ahụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria. Ha kporo oku ka a gbaa n'anwụ ngụkọ dị na 'server' Inec ka pati ọbụla mara ebe ha kwụ dịka ha na-ekwusi ike na ọ bụghị ihe Inec kwupụtara bụ ihe a tụtara na vootu. Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ Ọzọ, Atiku gbaghakwara sị na Buhari enweghị agụmakwụkwọ tozuru ya ịbụ onyeisiala. Iwu Naijiria nke afọ 1999 akụkụ nke 131 kwuru na onye ga-abụ onyeisiala ga abụ : ""Onye gụrụ opekata mpe 'school certificate' maọbụ oyiri ya."" Nkwa Buhari na Atiku: Ihe Ndigbo chere Mkpebi abụọ nwereike sepụte isi taa Okwu Server N'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọgụstụ Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa kagburu atụmatụ PDP inyocha igwe ""server"" Inec. Ndị Ọkaiwu ise nọ na ngalaba a Dattijo Muhammad bu onyeisi ha sị cha cha ma ncha na ha agaghị ekwe n'arịrịọ PDP na onye zọrọ ọchichị n'okpuuru ha bụ Atiku Abubakar maka ihe ndị ọzọ metụtara okwu ""server"" a. Na mkpebi ha, Ụlọikpe a sị na Inec agọọla na ha enweghị ""server"" ma kwukwa na ha ejighị usoro tecknuzu ọbụla kpokoo ọnụọgụgụ vootu gaa ""server"" ọbụla dịka PDP na Atiku siri kwuo. Okwu etosughi ịzọ ọchịchị N'ikpe metụtara Buhari itozu ịzọ ọchịchị ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Fraide bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ 2019 kụpụ n'akụkụ, akwụkwọ a gbara na-ekwu na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala na ntuliaka 2019. Na mkpebi ụloikpe nke ọkaikpe atọ n'isi ya Jọstis Mohammed Idris kwuru na a gbara akwụkwọ ahụ mgbe ọ gaferela oge kwesịrị ka e weta ya bụ okwu n'ụlọikpe nke bụ abalị iri na anọ. Kalu Kalu, Labaran Ismail and Hassy El-Kuris gbaburu akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji gbaghaa na Buhari etozughị ịbụ onyeisiala. mana ụlọikpe ahụ kụpụrụ ya, ha were gbagharịa akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe mgbegharị. Amabeghi ma nke ahụ ọ ga-emetụta ikpe nke taa. Ndị Ọkaikpe gbara mgba n'ụlọikpe maka ikpe a Akụkọ ga-amasi gi" afirika-50883663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50883663,Anambra steeti fire: Ọkụ gbara obi ndị ọrụoyibo,"Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ọkụ gbara n'ụlọọrụ gọọmentị dị n'Amawbia, Anambra steeti.","Ọkụ gbara obi ndị ọrụ n'Awka Ya bụ ọkụ metutara ụlọọrụ onyeisi ndị ọrụ bekee akpọrọ Head of Service na Bekee nke steeti ahụ bụ ebe ndị uweojii na-ekwu na ha amabeghị ihe bidoro ya bụ ọkụ ruo ugbua. Onyeisi ndị uweojii bụ John Abang ehiwela kọmitti ka enyocha ihe bidoro ya bụ ọkụ. GIGM sị na ọnweghị ndị atọọrọ n'ụgbọla ha Ndị ọrụ Good is Good Motors ekwuola na-ọnweghị dị atọọrọ n'ụgbọala ha mere njem ụnyahụ bụ Satọde. Ha dere n'akara Twitter ha na ndị ọkwọụgbọala ha niile lọtachara n'udo na njem ha mere. Gọọmenti Naịjirịa sị na ha anaghị akpaoke okwukwe Ọzọ, gọọmenti Naịjirịa agọọla n'ebobo ahụ na-agụnye ha na mba na-enweghị nkwaugwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi ndị mmadụ abụghị eziokwu. Mba Amerika gụnyere Naịjirịa na mba na-enweghị nkwanye ukwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi bụ nke ọnụ na-ekwuru gọọmenti ahụ bụ Lai Muhammed sị na ọ bụ asị. Modi asaala aka agụgọ maka iwu na-eso okwu Onyeisi mba India Narendra Modi sị na ọ bụ ndị pati ndorondoro ọchịchị ọzọ na-akpụta okwu a N'ofesi, Onyeisiala India bụ Narendra Modi achiliela aka gọọ na iwu ahụ ha tiri abụghị maka imegide ndị okpukperechi Alakụba. Modi sị na ya bụ iwu bụ maka iji chekwaba ndị nọ na mkpagbu na mba ahụ. Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na ngagharịiwe maka iwu a ha sị na ọ bụ mkpagbu nye ndị ụka Alakụba. Watford egbuo Man. U Paul Pogba dịla anị mgbe a gbaturu ya Ụnụ ahụlanụ na ndị kpee azụ ebuwela ụzọ taa na Premia Lig ebe Manchester United ghọrọ itibọrịbọ n'aka Watford n'asọmpị ha taa na. Watford ji ọkpụ abụọ asataghị ihe merie Manchester United ebe Chelsea jikwa ọkpụ abụọ asataghị ihe ọbụla nyụọ Tottenham Hotspur anya. Gee akụkọ ndị na otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị uweojii Abuja akatọọla ogbugbu onye otu ha ji ọkwa 'Inspector' gbagburu ibe ya ji ọkwa 'Corporal' ma gbuokwa onwe ya. Onye ASP ndị uweojii bụ Mariam Yusuf sị na nke a mere n'ubọchị Satọde n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Dutse Alhaji dị n'Abuja. Ọ sị na 'inspector' ahụ gbara onye 'corporal' egbe merụọ osote 'superintendent' ahụ tupu o gbuo onwe ya. Yusuf sị na kọmishọna ndị uweojii bụ Bala Ciroma enyela iwu ka e mee ezigbo nyocha banyere nke a. Ọ sịrị na ndị uweojii na-eti ezinaụlọ ndị a nwụrụ anwụ aka n'obi. Gọọmenti etiti ekwela nkwa na ọkụ latrik ga-abụ sara na mbido, n'etiti nakwa ngwụcha oge ekeresimesi a. Minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Goddy Jedy-Agba kwuru nke a oge enyocha ngwa ọkụ latrik Azura dị n'obodo Ihovbor nke Edo steeti. Jedy-Agba kwuru na ọkụ latrik a na-ewepụta ugbua karịrị ka ọ dị na mbụ. Ọ sị na ndị ọrụ na-ewepụta ọkụ nakwa ndị na-ekesa ọkụ nakwa gọọmentị na-arụkọ ọnụ iji mezuo nkwa a. Jedy-Agba dọkwara aka na ntị megide ndị mmadụ izu maọbụ imebi akụrụngwa ọkụ latrik n'ụzọ ọbụla. N'ofesi Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron arịọla otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọala arịrịọ ka ha kwụsị abụbụ ọrụ ha gbara nke ga-emegide njem n'oge ekeresimesi a. Ọ sị ka ndị ọrụ biko jiri maka nsọpụrụ ha nwere n'ebe ezinaụlọ ha nọ mee udo. N'egwuregwu Manchester United na Watford ga-adọbiri ya n'asompi Premier League mgbe Watford ga-ele ha ọbịa. A na-atụanya na Paul Pogba ga-eso gbaa asọmpi a dịka ọ nọchara ọnwa anọ na-agbaghị bọọlụ n'ihi mmerụ ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ndụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ Onyeisiala Buhari etiela mkpu maka agụmaakwụkwọ Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị nkuzi Mahadum ka ha gbalịa na-azụ ụmụakwụkwọ nke ọma ka ha nwee ike baa uru n'ebe ha na-arụ ọrụ. O kpọrọ oku a n'emume mpụta na mahadum Tekịnụzụ dị n'Akure ebe osote odeakụkwọ otu jikọtara Mahadum bụ Suleiman Ramon-Yusuf nọchiri anya ya. Anyị ụwa niile dị na mahadum anyị - Unilag Onyeisi mahadum Lagos bụ Ọkammụta Oluwatoyin Ogundipe sị na mahadum ahụ aghaghị agba nkịtị n'okwu ndị nkuzi abụọ wakporo ụmụakwụkwọ Ọ sị na anya ụwa niile nọ n'ebe ha nọ iji mara ihe ha ga-eme banyere nyocha na ntaramahụhụ ndị nkuzi ahụ. Ọka mmụta Boniface Igbenehue N'ofesi Onyeisiala mba Cuba bụ Miguel Diaz-Canel ahọpụtala Manuel Marrero Cruz dịka praịm minista mbụ ha n'ime ihe karịrị afọ iri anọ. Cheta Fidel Castro kachapụrụ ọkwa praịm minista na mba ahụ n'afọ 1976 mgbe ọ nọ dịka onye ndu mgbanwe. N'egwuregwu Roberto Firmino scored an injury-time winner as Liverpool defeated Monterrey 2-1 to reach their second Club World Cup final Liverpool amabutela Iko Club World Cup nke mbụ ha site n'imeri ndị Flamengos nke Brazil n'agba nke ịkpeazụ asọmpi ahụ. Ọ bụ otu ọkpụ goolu nke Roberto Firmino nyere na ngwụcha oge nyere ha aka ịmabute iko a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49977809,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49977809,Nigerian Celebrities: Lee ka izu a siri gaara ha,"Ndị a ma ama nke pụtara ""celebrities"" na Bekee na-ebi ndụ dị iche na nke mụ na gị.","Regina Daniels Ya mere na dịka izuụka a na-abịa na njedebe anyị ga-eme ngụkọ gbasara ha. Ngụkọ ga-agụnye ihe mere ha bụ ndị a ma ama na ihe ha mere. Chee aka ghọrọ ya 1. Ụbọchị ncheta ọmụmụ Kelechi Ihenacho End of Instagram post, 1 2. Iyke Cindy na Elo nke #BBNaija bịara n'ụlọọrụ BBC 3 Rita Dominic n'ekike jioji pụrụiche 4. Phyno na-enye ekele maka afo ọhụrụ ya 5. John Mikel Obi na ụtọndụ ya na-enweta onwe ha 6. Nne Charly Boy nwụrụ 7. Otiegwu Sky B a nwụrụ ka ọ dị ndụ? 8. Regina Daniels chetara ụbọchị ọmụmụ ya" afirika-49238345,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49238345,Enugu Kidnapping: A tọhapụla Eze ndị Agbogugu na nwunye ya,"Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị ugbua na-ekwu na a tọhapụla Igwe Sunday Orji bụ Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu, Enugwu Steeti.","Igwe Sunday Orji na Nwunye ya Cheta na ndị ekperima tọọrọ Eze ahụ na nwunye ya mgbe ha si ebe ha gara mmemme alọta na Sọnde, abalị anọ nke ọnwa Ọgọst. Mazị Nwafor Chiedozie, onye e ji CNN mara, ziteere BBC Igbo ozi a n'uhuruchi taa bụ Wenezdee. O dere sị: ""Igwe na nwunye ya e nwerela onwe ha"". Chiedozie bụ onye jibu ọkwa ""Councilor"" n'Agbogugu ma bụrụkwa onye so zọọ ndọrọndọrọ maka onyeisioche okpuruọchịchị Awgu n'afọ 2017. Ọ kọwaghị etu e si gbapụta Eze ahụ na nwunye ya. Igwe Sunday Orji Mana Ebere Amarizu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti, gwara BBC Igbo na Igwe Orji na nwunye enwerela onwe ha n'ezie. Mgbe anyị jụrụ ya ma a kwụrụ ndị ntọ ahụ ụgwọ tupu ha a tọhapụ ha, o kwuru na ndị uweojii anaghị akwụ onye maọbụ ndị ọbụla ụgwọ. N'okwu ya, ""anyị na-agbazị mbọ ugbua ịnwụchị ndị ekperima kpara arụ a."" Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gbagburu ụkọchukwu Paul Offu na Tọọzde gara aga Chetakwa na ọ bụ n'okirikiri ebe a nọ tọrọ Eze ahụ ka ndị omekome nọ gbagbuo otu ụkọchukwu ụka Katọlik aha ya bụ Paul Offu n'izuuka gara aga. Dịka Chiedozie siri kwuo mgbe ihe ka mechara, ndị uweojii gbalịrị nke ọma ịchọta Eze ọdinala ahụ. Ụgbọelu ndị uweojii na-erugharị n'okirikiri Agbogugu dịka ha na-achọ Eze ndị obodo ahụ ndị ntọ ji. O kwuru na ụgbọla ndị uweojii anọ na-akpagharị n'okirikiri obodo ha oge ahụ. O kwukwara na ọ hụrụ otu ụgbọelu ndị uweojii ka ọ na-erughari. ""Nke a pụtara na ndị uweojii na-agba mbọ i ji hụ na eze anyị pụtara."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-50712066,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50712066,Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua?,Ndị otu kpọrọ onwe ha Concerned Youths of Niger-Delta (CYND) chọrọ ka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) rịọ Rotimi Amaechi mgbaghara.,"Nke a si n'okwu Ipob ziputara, ebe ha sị na ọ bụ ha wakporo ma tie Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjiria ihe n'obodo Madrid dị na mba Spen. Cheta na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful kwenyere na ha bụ ndị Ipob chọrọ iwakpo Amaechi na mba Spen ka ọ gara ọgbakọ maka mgbanwe ihu eluigwe. Amaechi gbara ama ihe mwakpo a n'akara Twitter ya: End of Twitter post, 1 Amaechi gakwara n'ihu, site n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụrụ, kwuo na ndị Ipob akpaghị ya aka, n'agbanyeghị ihe Ipob na-ekwu. Ihe onyonyo ndị Ipob tinyere na soshal midia gosikwara ka ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na ha ""enweteghị"" Amaechi. Nke a na-egosi na eziokwu nwereike ịdị n'ihe Minista Njem na-ekwu. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful ka o tinye ọnụ n'okwu a otu a si na ha na-ekwuru ndị Naịja Delta kwuru, mana ekwentị ya agaghị. BBC Igbo kpọkwara ndị na-ekwuru Maazị Amaechi mana ha sị na okwu a otu a kwuru abụghị ihe ha ga-etinyenwu ọnụ makana ha amaghị ebe ya bụ otu si pụta. Mwakpo ndị nọ n'ọchịchị bụ atụmatụ ọhụru Ipob wepụtara site n'oge ha wakporo onye bụbu osote onyeisi Ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu na mba Jamini. Nyocha BBC Igbo mere maka otu CYND a gosiri na ọ bụ ka ha wepụtara okwu a ka ebu ụzọ nụ maka ha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Oriri Eri n'Aguleri: Ihe mere Oriri Eri ji ewu ewu" afirika-48175870,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48175870,EFCC akpụpụla onye ọrụ ụlọakụ ụlọikpe maka igwu wayo N187m,EFCC akpụla onye ọrụ ụlọakụ ụlọikpe maka ikwu wayo N187m,"Akụkọ ndị dị mkpa: EFCC ngalaba nke Enugwu akpụpụla Oliver Anidiobi, onye bụbụ onyeisi ngalaba ụlọakụ( a chọghị ịkpọ aha ha) n'ụlọikpe ukwu dị n'Enugwu maka ebubo ikwu chamdum nde otu narị naira na iri asatọ na asaa. A na-ebo Anidiobi ebubo iji ọkwa ya dịka onye na-ahụ maka akpaego obere ụlọakụ a kpọrọ 'OHHA Microfinance Bank' napụta ha ego ruru N187 ma zupu ya were ya rụọ ụlọelu ma zụkwa ala n'ebe dị iche iche. n'Enugwu. Ọ bụ mgbe obere ụlọakụ ahụ chọọ imechi agbaego ha nwere n'ụlọakụ ahụ ka ha chọọpụtara na ego ha adaala mmiri. Oge a gụpụtara ebubo ndị e boro Anidiobi nke gụnyere ịkpụ akwụkwọ nakwa izu ego ụlọakụ, o kwuru na 'ikpe amaghị ya.' Okaikpe Ajah, onye lebanyere anya n'ikpe ahụ higharịrị ikpe ahụ rue abalị asaa nke ọnwa Juun ma nye iwu ka a tụnye Anidiobi na mkpọrọ. Onye Naijiria abụrụla onyeisi ọgbakọ United Nations Ọkammụta Tijjani Mohammad Bande abụrụla onyeisi ọgbakọ United Nations ọhụrụ. Ọ bụ onyeisi nke na-apụ apụ bụ María Fernanda Espinosa Garcés gbara nke a n'anwụ na mkparịtaụka ha na Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama n'obi gọọmentị dị n'Abuja. Ndị na-egosi iwe n'Abuja Ọ bụkwa n'Abuja ka ndị na-eme ngosiwe gbochiri ụgbọala ọsote aka na-achị Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo. Iwe ha bụ na ndịagha na-achọ ịnapụ ha ala ebe ha bi dịka Ọkammụta Osinbajo kwere ha nkwa na ọ ga-elebanye anya na okwu ahụ. Na mba ofesi, Ndị uweojii na mba Mozambique anwụchiela mmadụ abụo eboro ebubo na ha tọrọ ma kwọgbuo ọtụ nwatakịrị anyarị na mba ahụ. Ndị uweojii kwukwara na ndị ahụ anwuchiri ekwetaala na aka ha dị n'ọnwụ nwa ahụ. N'egwuregwu, Onye na-achịkọta otu Super Eagles nke Nịajirịa bụ Gernot Rohr ekwuola na o nwere olileanya na-aga ahazi okwu gbasara Samuel Chukwueze Cheta na otu Villareal bụ ebe Chukwueze na-agba ekweghi hapụ ya soro gbaa n'asọmpị iko mba Afrịka. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ipob agbarụọla ihu nye ndị ọchịchị IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti Ipob agbarụọla ihu maka nkatọ Dave Umahi, Willie Obiano nakwa Nnia Nwodo katọrọ atụmatụ ịgba abụbụ site na-ịtụkwụ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee. Onye ozi Ipob bụ Emma Powerful sị na ndị isi a dị mma ịmere ebere maka uche ha dị na-azụm ahị otu ụbọchị karịa nwere onwe Biafra. Global Road Safety week: Onye Road Safety ọbụla e jidere na-eri ngari ga-ata ahụhụ - FRSC Ndị ọrụ nchekwa njem okporoụzọ Mmemme ncheta izu ụka ndị ọrụ nchekwa n'okporoụzọ nke a kpọrọ 'Road Safety Week' amalitela n'Enugwu.Isi okwu mmemme ahụ nke afọ a bụ""Leadership for Road safety."" Dịka Sector Commander FRSC , Ogbonnia Kalu siri gwa ndị ntaakụkọ n'Enugwu, gọọmentị nke etiti, nke steeti nakwa United Nations ejikọla aka ịhụ na-echekwara ndụ ndị mmadụ. Kọmishịọna na-ahụ maka njem bụ Vitus Okechi gwara ndị FRSC na ndị ọrụ ya ga na- adọnyere ndị ọrụ nchekwa okporouzọ ukwu oge niile. Okechi gwara ọha ndị mmadụ, ka ha wetara ya aha ndi ọrụ ya ọbụla na-akpa agwa ekwesịghị ekwesị.Iji zaa ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ , Sector Commander Ogbonnia Kalu kwuru na onye ọrụ ya ọbụla e jidere ka ọ nara akaazụ ga-ata ahụhụ dịka iwu Naijiri siri kwuo. George Weah akwụsịla Mịnịsta mgbasaozi ya ọrụ n'ike maka okwu asị George Weah bu onye gbaburu boolu tupu ọ banye n' ndọrọndọrọ ọchịchị Onyeisiala mba Liberia agwala osote mịnịsta mgbasaozi mba ahụ bụ Eugene Fahngon ka ọ nọtụ n'ụlọ nwa oge maka okwu ịkpa oke agbụrụ o kwuru n' igwe okwu Facebook ya. Nke a na-eme dịka mba Amerịka katọchara okwu ahụ Fahngon kwuru. Fahngon katọrọ ngagharịiwe megide gọọmentị nke e hiwere ga-eme n'abalị asaa nke ọnwa Juun nke o boro ndị sị n'agbụrụ ndị ohu a tọhapụrụ atọha site na mba Amerịka ndị ọ kpọrọ 'ndị Liberia si Congo.' N'ozi ha wepụtara, ụlọnnochịte anya mba Amerịka na Liberia sị n'okwu ahụ ekwesịghị ekwesịghị. Ha kpọrọ oku ka onye ọbụla lekwasị anya n' kwalite obodo na ịkpa udo. Ụlọikpe atọhapụla Adeleke ma higharia ikpe ya Ademola Adeleke zọọ ọkwa gọvanọ Osun steeti n'aha PDP n'afọ 2018 Ụlọikpe majie nke Mpape dị n' Abuja atọhapụla Senatọ Ademola Adeleke, onye zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'ọnụ egọ nde naira abụọ ma higharịa ikpe ahụ n'abalị 24 nke Juun afọ 2019. Cheta na ndị uweojii nwụchiburu Adeleke taa maka ebubo ' ịkpụ asambodo adịgboroja.' Ndị PDP na-ebo ebubo na njide a bụ ka e were megharịa Adeleke anya maka mkpụpụ ọ kpụpụrụ otu APC n'ụlọikpe maka ndọrọndọrọ okwa gọvanọ o kwenyere na ya meriri. Boko Haram akaghị ndị agha eri ụkwọ Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ Ndị otu mgbasa ozi onyeisiala Buhari ekwuola na ebubo na Boko Haram ka ndị agha Naịjirịa eri ụgwọ ọnwa bụ ajambele. Onyeisi ndị otu a bụ Niyi Akinsiju kwuru na kama, agụụ na anyụ ndị Boko Haram anya maka ụdịrị agha a na-ebuso ha ugbua. Prime Minister Australia agwọrọ odeshi? Scott Morrison Prime Minster Australia N'ofesi, Prime Minister mba Australia aghọọla oji isi aghọ mgbo. Atụrụ scott Morrison akwa n'isi ebe ọ na-achụ nta vootu mana akwa ahụ akụwaghị, kama ọ gara kwatuo otu agadị nwaanyị kwụ na akụkụ. Man. City emeriela Liverpool Man. City 1 - 0 Liverpool N'egwuruegwu e, Manchester City gara be mmuo napụta Leicester city otu ọkpụ goolu ha jiri merie ha na Premier League ụnyahụ. Mmeri a mere ka Man City bụrụ akwaa akwụrụ dịka ka ndị mbụ na ogoogo Premier League. Ụlọikpe atọghapụla Adeleke ma higharia ikpe ya Gee Nkeji Igbo ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" media-52450026,https://www.bbc.com/igbo/media-52450026,Chioma Davido: Ị mana nwaada Igbo a bụ...,Ị ma ihe mere ndị mmadụ ji hụ Chioma n'anya?Chioma Avril Rowland bụ onye ndị mmadụ matara site na ọyị ya na otiegwu a ma ama bụ Davido na-ayị.,"Ha abụọ malitere ịyị onwe ha mgbe ha zutere na Mahadum mana ugbua, ọ fọziri obere ka ha bụrụ di na nwunye. N'afọ 2019, Davido depụtara na ọ gaala hụ ezinaụlọ Chiome nke Bekee kpọrọ ""Introduction"". Mana ewezụga Davido, ị ma na o nwere ụfọdụ ihe ị maghị maka Chioma?Lee ya ebe a 1. Chioma bụ osite kajara akaja nke mere na ""Chef chi"" a na-etu ya abụghị na nkịtị. Ị chọọ ịma maọbụ eziokwu gaa na peeji Instagram ya @Thechefchi 2. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock nke dị n'Ogun steeti ebe ọ gụrụ ""Economics"" Ọ bụkwa ebe ahu ka o zutere Davido na-agụ ""Music"" n'otu Mahadum ahụ kwa. 3. Chioma, nne ya na nna ya nakwa ụmụ nwanne ya bụ ndị Imo steeti. Ha ncha bụkwa ndị ụka ""Seventh Day Adventist"" 4 Onweghi onye ma oke ihe maka ezinaụlọ ya mana o nwere otu nwanne ya nwaanyị a na-akpọ Jennifer na-akwa akwa. 5. Chioma mụọrọ Davido nwa nke atọ ya na nwa nwoke mbụ n'ọnwa Ọktoba afọ 2019. Ha gụrụ nwa ahụ David Ifeanyi Adeleke. Nke a mere ka ufọdụ mmadụ na-akpọ Chioma ""Mama Ifeanyi"". 6. N'ụbọchị 27 nke ọnwa Maaachị afọ 2020, Davido kwuru na Chioma butere ọrịa Coronavirus. Akụkọ a pụtara ihe dịka ha si njem mba Amerịka bata Naịjirịa. Mana n'ụbọchị 19 nke ọnwa Eprelu, Davido depụtakwara na ọ gbakeela n'ọrịa ahụ. Akụkọ ndị ga-masị gị:" afirika-52212471,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52212471,A na-ebo onye nwe ụlọọrụ onye na-enyere ndị mmadụ aka enwete visa ebubo nrụrụaka na ohi,Nnyocha BBC na Premium Times mere na-egosi na aha nwaamadị nwe ụlọọrụ ahụ na-enyere ndị chọrọ ịnwete visa Naịjịria aka site na mba ofesi nọ n'akwụkwọ ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) maka ebubo ibuba ego ọha nakwa ibufe ya ofesi.,"N'ezie, ahụghị aka ya bụ ụlọọrụ na-enye visa maọbụ ndị ọru ya na ya bụ nnyocha emere, mana EFCC na-ebo onye nwe ya bụ ụlọọrụ bụ Mahmood Ahmad na ụlọrụ ya bụ Drexel Tech ebubo ọnụ abụọ maka ibu ego ọha nakwa ebubo ọnụ atọ maka ibufe ya bụ ego mba ofesi. Aha mmadụ atọ ndị ọzọ dịkwa na ya bụ ikpe, dịka Abba Moro, onye bụbu Minista na-ahụ maka nchekwa ime Naịjirịa Bekee kpọrọ 'Interior Minister' n'oge Goodluck Jonathan bụ onye EFCC boro ebubo ibuba ego ọha nakwa ịda iwu usoro eji egote ihe gọọmenti. Ndị niile eboro ya bụ ebubo gụnyere Abba Moro na Ahmadu sị na aka ha dị ọcha. Ahmadu so na ndị a na-akwanyere ugwu na Naịjirịa nke mere eji nye ya otu n'ime nturuugo kacha elu na Naịjịrịa akpọrọ ""Order of the Niger"" na Bekee na 2014 oge Jonathan na-achị. Ndị ọkaiwu ya na-agọ na-ọnweghị mgbe Ahmadu ji nwee ajụjụ ọbụla ọ na-aza n'ụlọikpe ọbụla. Ndị azọgburu na ọgbọ egwuregwu n'Abuja Ndị na-acho ọrụ nwụrụ na ọdọ egwuregwu dị n'Abuja ka ha na-acho ọrụ 'Imigration' Mana akwụkwọ EFCC na-egosi na aha Ahmadu so na ndị eboro ebubo maka ihe ha kpokobara maka iwee ọrụ nke ọtụtụ mmadụ nwuru n'ime ya na Naịjirịa. Ụlọọrụ ya mbụ bụ Drexel Tech bụ ha kpokọbara emume iwee ya bụ ọrụ nke ha sị na ""Nigeria Immigration Services"" (NIS) chọrọ iwe ihe ruru mmadụ puku anọ (4,000) n'ọrụ. Mana ndị NIS gọrọ na ha amaghị maka ya bụ ọrụ Drexel chọrọ iwe. Mmadụ dị puku isii, ịrị asaa na isii na narị iri isi, iri asaa na ise (676,675) tinyere akwụkwọ maka ya bụ ọrụ. Ndị nchịpkọta ya bụ emume nara otu onye ndị chọrọ ya bụ ọrụ otu puku naịra. Ndị mmadụ na-achọ ọrụ zogburu ibe ha n'ama egwuregwu nke Abuja bụ ebe ha mere ya bụ ihe nke ha sị na ọ bụ Ministrị ""Interior"" kpokobara ya. Onyeisi ụlọọrụ ndị ""Immigration"" mgbe ahụ bụ David Paradang zara n'ụlọikpe ukwu n'Abuja, ""ya bụ ihe mere na ya bụ ama egwuregwu turu m n'anya maka na amaghị maka ya"". Akwụkwọ ebubo ndị EFCC sị na ya bụ nwaamadị a na-achọ achọ bụ Ahmadu nwetere ego ruru nde narị naira isii na iri asaa na asaa (N677m) site n'otu puku ha nara ndị bịara ịchọ ya bụ ọrụ. Akwụkwọ ebubo ahụ sị na Ahmadu na ụlọọrụ ya bụ Drexel tinyere ụfọdụ ego ha nwetere na'ụlọ ha gogasiri n'Abuja. Ha gbanwekwara ụfọdụ ya na dọla bụ nke Ahmadu na onwe ya riri. Ka ọ dị ugbua, mmadụ niile eboro ya bụ ebubo ibuba ego nke gụnyere Abba Moro na-azara ọnụ ha n'ụloikpe mana ahụbeghị ukwu Ahmadu ebe ahụ kemgbe ahụ. N'afọ 2016 ka ọnụ na-kwuru EFCC mgbe ahụ bụ Wilson Uwujiaren turuọnụ sị ""anyị ga-ejideriri Mahmood Ahmadu, ebe ọsọrọ ya gbagaa. Anyị nụrụ na ọ nwere ụlọọrụ na mba Uk. Anyị ga-eji Interpol ga kpụta ya. Onye nwere ebe nzuzo. Aha ya abanyelarị n'akwụkwọ ndị anyị na-achọ achọ"". Izu gara aga, ọnụ na-ekwuru EFCC ugbua bụ Tony Orilade gwara BBC na Ahmadu ka nwere ikpe ọ ga-aza n'aka ha. ""Akwụkwọ ebubo ka na-egosị na ana achọ ya bụ nwaamadị achọ"" Ndị ọrụ anyị ka na-ekwusi ike na iwu megidere ya bụ ọgbakọ okpokobara maka ịwe ọrụ"". Ọbaozi, 'website' ndị ụlọọrụ ya bụ Online Integrated Solutions (OIS) ka na egosi na ha ka nọ na mba iri abụọ na ise dịka Nigeria, China, Lebanon, UAE, Malaysia, Italy, Netherlands, South Africa, USA , France, Germany, UK, India, na Canada ebe ha na-arụchitere gọọmenti Naịjirịa ọrụ. Ụlọọrụ ahụ sị na ọ bụ ha bụ ọkachamma n'ime ka ndị mmadụ nweta akwụkwọ njem ha ngwangwa n'ụwa gbaa gburugburu. BBC gbara mbọ ịkwuru ndị Interior Ministry nakwa ndị High Commission mana ha ekweghị etinye ọnụ na ya bụ okwu. Ụlọọrụ ndị Department for Business, Energy and Industrial Strategy nke UK sị na ""onye mbịarambịa amara ikpe na mba ọzọ nwere ike ịchụnta ego na mba UK na-enweghị nsogbu""." afirika-45088457,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45088457,Saraki akpọọla ndị isi ụlọomeiwu oku,Onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu bụ Bukola Saraki na ndị isi ụlọomeiwu nke ukwu na nke nta ga-enwe nzụkọ n'ụlọọrụ ya n'Abuja taa bu Tusde.,"Otu onye ya na Saraki na-akpakọ bụ onye gwara BBC nke a. O kwuru na nzụkọ a, nke ga-emetụta ndị Sineti na ndị ogbo ha n'ụlọomeiwu nke nta, bụ ihe dị mkpa maka okwu na ihe ndị ha ga-ahazị. Ọ sị na okwu ha ga-emụtata ntuliaka nke afọ 2019 na ihe gbasara ngafe pati na-eme n'etiti ndị omeiwu na ndị ndọrọndọrọ ọzọ. Mana o kwuru na-agaghị etinye ọnụ n'ihe banyere ọnọdụ Saraki dịka onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa. ""Nke a abụghị otu n'ime ihe anyị ga etinye ọnụ,"" onye a gwara BBC. Na ngwụcha ọnwa gara aga, ndị ụlomeiwu gara ezumike dịka ọtụtụ mmadụ si pati na-achị bụ APC gawa PDP. Ugbua, enwere akụkọ BBC amagbeghị isi ya na-ekwu na ndị APC chọro ịchụtụ Saraki n'ọkwa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 45109775,https://www.bbc.com/igbo/45109775,Yemen: UN etinyela ọnụ n'ụmụaka 29 ndịagha Saudi gburu na Yemen,"Onyeisi ngalaba UN na Yemen bụ Martin Griffiths sị na yabụrụ na agha Yemen akwụsịghị, obodo ahụ ga-akanjọ karịa Syria.","Otu ICRC kwuru na ha na-enyere ụlọọgwụ ndị nwere ọtụtụ ndị ọrịa aka site n'inye ha ngwọ ọrụ Cheta na ihe karịrị ụmụaka 29 anwụrụ ebe mmadụ 30 ndị ọzọ merụrụ ahụ ụnyaahụ ka ndịagha Sawudi ji ogbunigwe elu buso ndị Yemen agha. Ụmụaka ahụ nọ n'ime ụgbọala kwusiri n'ime ahia mbge ogbunigwe ahụ ndị Sawudi tụrụ na Dahyan dị na mpaghara Saada dara. Ngalaba ọrụ ahụike nke Houthi na-ahazi kwuru na mmadị 43 bụ ndị nwụrụ ebe mmadụ 61 bụ ndị merụrụ ahụ. Otu na-akwado mba Yemen na-ebu agha emegi ndị Houthis kwuru na ha kpachara anya mee ihe ha mere. Mana ha na-ekwu na ọbụghị ndị nkịtị ka ha kwadoro agha ahụ mana ndị na-ahụ maka oke na ugwu diri mmadụ na-ebo ha ebubo na ha tụrụ ogbunigwe n'ime ahịa, n'ụlọakwụkwọ, n'ụlọọgwụ nakwa ebe ndị mmadụ bi. Mba Amerịka, bụ ndị na-eresi Saudi Arabia ngwa agha ha ji anu ọgụ, katọrọ arụ a mere ma sị ka Saudi me nyocha iji mara etu o ji mee. N'aka nke ọzọ, onye ọrụ UN e wetara ọhụrụ ịnọchite Yemen bụ Martin Griffiths kwuru na ya na-atụ anya ime ọgbakọ n'etiti ndị na-ese okwu a n'ọnwa Sepụtembba na Giviniva ka ha nwee mkparịtaụka." afirika-51005225,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51005225,Electricity tariff: NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla,"Ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ na Naịjirịa bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (Nerc), ekwuola na enwebeghi mgbanwe n'ụgwọ ọkụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ.","Ha kwuru na ihe ha biputara na-egosi ụgwọ a ga na-akwụ n'afọ 2020 a, bụ nke na-egosi ihe iwu nagidere ha ị na-eme dịka ndị na-ekesa ọkụ latrik. James Momoh bụ onyeisioche ngalaba Nerc kwuru na ha na-eme mbiputa a ugboro abụọ n'afọ, na ha emeela nke mbụ n'ọnwa Juun, ga-emekwa ya na Jenụwarị a, n'ihi na ọ bụ ọrụ ha. O kwuru na n'ime ihe dị ka ọnwa atọ na-abịa, na ha ga ekwuputa ihe ha ga-achọpụta na ngagharị ha ga-eme; na ọ bụrụ na ha mechaa nzukọ ndị a kwuo na 'a gaghị etinyekwu ego"", ọ pụtara na agaghị enwe mbulie ụgwọ ọbụla. ""Mana ọ bụrụ na a ga-etinyekwu ego, ọ ga-abụ maka ihe anyi kwutere na nzukọ"". ""Anyị ga-agbasa ozi ga-akọwa ihe anyị kpebiri na nzukọ a, n'ụzọ onye ọbụla ga-aghọta, iwepụ mgbagwoju anya si na nke anyị biputaburu mbụ. ""Anyị na ngalaba na-ahụ maka nrụpụta ihe bụ Manufacturers Association of Nigeria nakwa ndị na-amụ ọkụ latrik ga-ekpebi tupu anyị ekpebie."" Kedụ ebe ndị bi n'Enugwu steeti kwụ gbasara ịkwụ N40,000 maka mita ọkụ latrik? Ndị bi n'Enugwu steeti arịọla ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-agwa ha ka ha kwụọ puku iri anọ maka inweta mita ọhụrụ. Ha kwuru na ha amaghi ebe ha kwụ akwụ n'okwu a, dịka EEDC bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịkesa ọkụ latrik, gwara ha cheretu, oge ha gara ịkwụ ụgwọ ọkụ ha. Ha kwuru sị na ndị EEDC kwuru na ha ga-abịa wepụ mita nke ochie, tinye nke ọhụrụ tupu ndị mmadụ amalite ịkwụ ụgwọ a, nakwa ụgwọ ọbụla ha ji. Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo ka na-agbalị inweta onyeisi ndị EEDC n'ekwentị. Ọkụ agbagbuola nwa akwụkwo n'Ọnịcha Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na nwatakịrị dị afọ iri na otu nwụrụ n'ọkụ gbara n'ụlọakwụkwọ obibi Patterson memorial Grammar school di n'Ọnisha. Haruna kwuru na ha ka na-enyocha ịma ihe bidoro ọkụ ahụ gbara n'abalị ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị a, ka ụmụaka ka si ịgba ekeresimesi lọta akwụkwọ. Mwakpo mahadum dị n'Indịa, Ụmụakwụkwọ si ụlọakwụkwọ dị iche iche na mba India pụtara ime ngagharịiwe maka mwakpo a Ụmụakwụkwọ ndị mba India na-eme ngagharịiwe iji kwugide mwakpo ndị bu osisi wakporo ụmụakwụkwọ ibe ha na mahadum Jawaharlal Nehru dị n'obodo Delhi, ụbọchị ụka. Ha na-eme nke a ka ihe ruru ndị nkuzi nakwa ụmụakwụkwọ iri anọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ maka ihe e tiri ha. Ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu, Mario Balotelli enyerela Brescia goolu ise n'asọmpi Serie A n'afọ a Mario Balotelli sị ihere megbuo ndị na-akwado Lazio dị ka ha kwara ya emu ịkpa oke agbụrụ ka ha na Brescia zutere. Ihe mere ụkọchukwu ji sụgbuo nwunye ya ma onwe ya n'elu ọlta Otu ụkọchukwu egbuola onwe ya ma sụgbuo nwunye n'elu ọlta ka ha na-aka ụka ụbọchị Sọnde. Di na nwunye a bụ ndị hibere ụlọụka ahụ dị na Mombasa, Kenya. Ndị ụlọụka ahụ kwuru na Elisha Misiko bụ ụkọchukwu ahụ, nọkatara n'ihu oche tupu o mechaa gaa n'ebe nwunye ya bụ Ann Mghoi nọ n'elu ọlta, were ọtụtụ mma o zoro n'okpuru akwa ya sụkasịa nwunye ya ahụ. Ka o mechara nke a, o were mma ahụ sụọ onwe ya n'afọ ma bewa akpịrị ya mgbe ndị ụlọụka ji ọsọ gbata n'ọlta. Ọ nwụrụ ebe ahụ ozugbo ozugbo mana nwunye ya nwụrụ n'ụlọọgwụ. Di na nwunye a agbasaala kemgbe ma na-ese okwu onye ga-abụ onyeisi ụlọụka ahụ dịka ụlọ mgbasaozi Daily Nation newspaper si depụta. Ndị hụrụ ebe ihe a mere kọwaara ndị ntaakụkọ ka o si mee. Ndị isi okpuruọchịchị nọ n'Imo steeti ga-alaghachite ọrụ taa Mmadụ 27 bụ ndị isi oche okpuruọchịchị dị icheiche n'Imo steeti ga-alaghachi ọrụ taa. Ọ bụ ụlọikpe kachasị nyere ha ikike a site na mkpebi ya na ndị gọvanọ na onyeisiala enweghi ikike ịmanye aka n'ihe gbasara okpuruọchịchị. Cheta na gọọmentị Imo kwụsitụrụ ha ọrụ n'ọnwa Juun n'afọ 2019. Na Kaduna, Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ na gaasị gbara na Kaduna eruola isii dịka ndị uweojii nọ na steeti ahụ si depụta. Ha kwukwara na ngwongwo karịrị nde naira iri na isii bụ ihe furu n'ọkụ ahụ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Arsenal na Leeds ga-akwata ya na mgbede taa dịka egwuregwu FA Cup na-ebiri ọkụ. Bịa lee akụko iribama maka nwoke kpuru isi na-arụ egine dị iche iche na webụsaiti anyị bụ bbc igbo.com. Okwu Quasem Soleimani ka na-aga Dịka ọgbaghara na-ada n'ihi ọnwụ ọchịagha Quasem Soleimani n'aka ndị agha Amerịka, Onyeisiala Donald Trump eforola ntutu taa na aka ike ya ga-adakwasị mba Iraq maọbụrụ na ha chụpụ ndị agha Amerịka nọ n'ala ha. Okwu Trump na-abịa dịka ndị omeiwu Iraq na-agwa ndị agha Amerịka si mba ha kwara lawa. Igwe mmadụ gbakọrọ n'ụzọ Tehran bụ isi obodo Iran maka akwamozu onyeisi agha ha bụ Qassem Soleimani. Soleimanị nwụrụ ka ogbunigwe nke Onyeisala US bụ Donald Trump si ka atụọ dara n'Iraq. N'otu aka ahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Mohamed Adamu agwaala ndị otu ya dịrị njikere maka ọgbaghara ọbụla nwereike ịdapụta maka ọnwụ ọchịagha Iran bụ Quassem Soleimani. Okwu ya bịara dịka ọ nụrụ kepu kepu na ọtụtụ otu dị icheiche na-akwado ịme ngagharịiwe maka ogbugbu mba Amerịka gburu Soleimani. Tunde Bakare adụọla Buhari ndụmọdụ Ụkọchukwu bụ Tunde Bakare agwaala onyeisiala Muhammadu Buhari ya tinye anya n'onye ga-anọchi anya ya. O kwuru na ọ bụrụ na Buhari bu ọdịnma Naịjirịa n'obi na o kwesiri ị hazi onye ga-anọchi anya ya n'ọkwa. N'egwuregwu, Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 Enyimba nke Aba na-achọ ikuru ume ndụ dịka Plateau United fọjuru ha goolu afọ mgbe ha zutere n'asọmpị Oriental Derby Ọ bụ goolu anọ ka e ji merie Enyimba. Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo ga-amasị gị Blind Mechanic: Lee nwoke kpuru isi na-arụ 'Mechanic'" 44425345,https://www.bbc.com/igbo/44425345,Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Duke agụnyela na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n' abalị a :,"Osote onyeisiala mezuru ọchịchị onyeisi ya agaghị azọlizi ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro. Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu na-akwụsị osote onyeisila ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala karịa otu ugboro ma ọbụru na o mezuru ọchịchị onyeisiala ya. Nke a pụtara na onwere ihe mere onyeisiala jiri pụọ n'ọchịchị n'oge na-erughi eru, osote mezuo oge ọchịchị ya, ọ gaghị azọli ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro. Naịjirịa Donald Duke esonyela n'ọsọ ọkwa onyeisiala. Aka chịburu Cross River steeti bụ Donald Duke ekwupụtala ebumnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2019. O kwupụtara ebumnobi ya n'Anambra steeti ụnyaahụ ebe ọ gara ịgwa ndị ọkaiwu okwu. Ebe ọzọ na Naịjirịa Onyeisiala Buhari ga-aga Moroko echi. Onye nkwuchite ọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu kwuru na onyeisiala Moroko bụ Eze Mohammed nke isii bụ onye kpọrọ ya ka ọ bịa. Akụkọ mba ofesi Trump esila n'ọgbakọ G7 pụọ. Mba ndị ọzọ so na nkwekọrịta kwuru na aka ha adịghi n'ihe Trump mere Donald Trump ahapụla ọgbakọ G7 na-eme na Kanada gawa Singapore. Ya na ndị mba ọzọ na-akwata ya maka ihe gbasara azụmahịa n'etiti ha. N'egwuregwu, Ndị Super Eagles nwere onye ọbịa nọnyere ha ebe ha na-akwado asọmpi Iko Mbaụwa. Nwafọ Naịjirịa na-agbara mba Ọstrịa bọọlụ bụ David Alaba gara hụụ ndị Super Eagles ebe ha nọ akwado asọmpi Iko Mbaụwa. Alaba kelere ndị Naịjịrịa maka nkwado ha na-akwdo ya ma kpekwara ndị Super Eagles ekpere mmeri. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Di na nwunye mụrụ ejima atọ" afirika-43781296,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43781296,Commonwealth: Ihe asaa ị na maghị maka ya,"Ka ndị mba Commonwealth na-eme nzụkọ, lee ihe asaa ị maghị maka ọgbakọ a. 1) Otu ụzọ n'ụzọ atọ n'ime mmadụ niile nọ n'ụwa bi n'ime mba Commonwealth dị icheiche","Ihe ruru mmadụ ijeri 2.4 n'ime mmadụ ijeri 7.4 n'ụwa niile bi na mba ndị Commonwealth. Ụfọdụ ha erụbeghị afọ iri atọ. Mba kachasị n'ọnụọgụgụ bụ mba India nke mezuru ọkara ọnụọgụgụ a. 2) Mba Britain achịghị ọtụtụ n'ime ha n'oge gaara aga Belgium na Germany chịrị Rwanda mana UK achịghị ha Rwanda na Mozambique banyere n'afọ 2009 na 1995 ma o nweghị nke mba Britain chịburu. O nwekwara ndị sị n'otu a pụọ: Robert Mugabe kpọpụrụ ala Zimbabwe n'afọ 2003, a chụpụrụ Pakistan n'afọ 1999 ma nabatakwa ha mgbe afọ anọ gachara. Mba South Afịrịka pụrụ mgbe a katọrọ oke ha na-akpa n'etiti ndị ọcha na ndị ojii Mba ikpeazụ pụrụ na Commonwealth n'afọ 2016 bụ Maldives. 3) Ezenwaanyị Britain na-achị mba iri n'isii n'ime ọgbakọ a Ọtụtụ mba Commonwealth bụ Repọblịk, sọsọ isii n'ime ha Lesotho, Swaziland, Brunei Darussalam, Malaysia, Samoa na Tonga nwere eze nke ha. Tonga nwere eze nke ya bụ Tupou VI (etiti) 4) O hiri nne Mba ndị Commonwealth mezụrụ otu n'ime ọkara anọ ala dị n'ụwa niile. Mba kachasị bụ Canada. India na Australia hịkwara nne mana ọtụtụ n'ime ha dị obere dịka Nauru, Samoa, Tuvalu na Vanuatu, na Dominica kwa. Canada riri nne Nauru dị obere 5) Ọ gbanwela aha ya mbụ Ndị ọchịchị Commonwealth nwekwara nzụkọ n'afọ 1969 Ọgbakọ Commonwealth a bụ nke ọhụrụ a gbanwere n'afọ 1949 mgbe e wepụrụ ""British"" na aha ya. Sọsọ mmadụ abụọ chịrị otu Commonwealth ahụ mana ọ bụghị kwa ihe nna na-enye nwa ya mana a na-atụ anya na nwaeze Charles ga-arịgo ọkwa ọchịchị a mgbe ọ bụrụ eze. Mba ndị bidoro otu na mbụ bụ Australia, Canada, India, New Zealand, Pakistan, South Africa, Sri Lanka na mba Britain. 6) Mba Britain ka nwe ahịa kachasị... India nwereike ị gafe UK n'afọ a. GDP achịkọtara ọnụ ndị mba 53 a ruru $10tn (£7tn). O fọdụrụ obere ihe ka ya na nke China ha nhata nha, ebe nke ha bụ ($11tn, £7.7tn). 7) Commonwealth dị karịa otu. Commonwealth nke mba nwere onwe nwere nzụkọ na Minsk, Belarus Echezọna ngalaba ndị mba French na Commonwealth mba ndị nwereonweha a kpọrọ CIS na-aha ịchafụ mba ndị Soviet ochie bidoro n'afọ 1991. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-48482885,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48482885,CAF Champions League Final: Ndọrọndọrọ goolu na igwe VAR arụghi ọrụ ekweghị ka agbacha asọmpị,"N'abalị Mee 31, 2019 ka a gbara asọmpị ngwụcha nke akpọrọ African Champions League, nke butere Wydad Casablanca ka ha zute otu egwuregwu Esperance Tunis na ama egwuregwu Olympique de Rades dị na Tụnịshịa.","Ndị egwuregwu Wyded si na ogbu bọọlụ ga-ejiriri igwe VAR nyocha goolu ha akagburu Asọmpi ahụ gara etu asọmpị ndị ọzọ na-aga ruo nkeji iri isii na otu mgbe Wydad Casablanca sara ọkpụ goolu ES Tunis nyere ha. Ka ụmụ egwueregwu Casablanca ka na-eme ka ha racha pịọm, onye na-egbu egwuregwu ahụ kagburu goolu ahụ. Mba malitere rịwa ibe ya elu. Ịhụ na udo chịrị, ogbu bọọlụ tụrụ aka na igwe Bekee kpọrọ ""video Assistant Referee System"" (VAR), nke FIFA sịzị na ọ bụ ekwucha ọgwu n'ihe banyere esemokwu n'asọmpị. Mgbe ahụ ka ihe esinyere n'ekwu sị na ọ gaghị eghe - igwe VAR ekweghị aza oku. Akụkọ si na agwaghị ndi na gba bọọlụ na ihe a Bekee kpọrọ 'video assistant referee system' (VAR) anaghị arụ ọrụ Ka ana-eme ka ana-eme, Igwe VAR gbanyụrụ ọkụ nke mere ndị Casablanca jiri sị na ọ bụghị dị ha ka ana-agwa na nchi ọnya ha matara abụrụla ikuku. Ụmụ Casablanca were ticha ọkpụ ha, na ha adịghịzị agba bọọlụ ọbụla. Ụmụ Wydad ekweghịdị ịgba bọolụ ọbụla maka goolu ha akagburu Oge were gagide ka a na-arịọ ka ha kwete n'ihe ogbu bọọlụ kwuru ruo otu elekere na ọma. Mgbe ahụ ka onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka niile bụ CAF, Maazị Ahmad Ahmad jiir zọbata n'etiti ama egwueregwu ịmata ihe ji nkịta ọnwụ. Ihe na-eme n'ama egwuregwu mgbe ahụ bụ na ụmụ Esperance Tunis nọ na-agbara onwe ha bọolụ dịka ha na-amụzịrị onwe egwu. Emechara nye ES Tunis mmeri dịka CAF kwenyere na nkagbu onye na-egbu asọmpị kagburu goolu Casablanca. Ihe a abụghi mbu Igwe VAR na ebute ọgbaghara n'egwuregwu bọọlụ, mana nke a dịka anụ kpọrụ nkụ karịrị nwata ọnụ. Otu egwuregwu abụọ gbaburu otu ọkpụ ọkpụ mgbe a zutere n'agba nke mbụ n'obodo Rabat. Otu Egwuregwu Esperance ga-anọchịte anya Afrịka n'asọmpị akpọrọ FIFA Club World Cup a ga-agba n'ọnwa Decemba 2019. Esperancenatara mmeri ka ndi CAF gbubiri asọmpị ahụ" afirika-46114559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46114559,Lai Mohammed na Zakzaky: Etu nri si bute okwu,Onye na-ekwu eziokwu n'etiti Lai Mohammed na ndị otu Ibrahim El-Zakzaky?,"Mohammed kpalitere okwu na soshal midia ka o kwuru na gọọmentị ji nde naịra 3.5 enye Ibrahim El-zakzaky bụ onyeisi otu ""Islamic Movement of Nigeria"" nri. ""Islamic Movement of Nigeria"" bụ ndị eji Shiites mara. Na-erughi awa ole o kwuputara ihe a, BBC kpọrọ ụfọdụ ndị otu El-Zakzaky, ndị kwuru na ọ bụ asị ka Mohammed na-atụ. Ha kwuru na ha na-atụkọta ego ọnụ were na-egote ihe ma wegara onyeisi ha n'ụlọ mkpọrọ. Okwu a mere ndị mmadụ kpụrụ Mohammed n'ọnụ. Ihe ndị mmadụ kwuru @farooqkperogi kwuru na ọ dị ka ọ ga-akara Naịjirịa mma ịbụ ụlọ mkpọrọ ebe ọbụzị na onye nọ na mkpọrọ na-aka eripụta ahụ karịa ndị na-agagharịri onwe ha. @dadiyata gbariri ihe ego a sị na El-Zakzaky na-eri ga-azụtanwu n'ime otu ụbọchị. @Ennyholar_ kwuru na ebe ọ bụ na a na-eji ụdịrị ego a enye El-Zakzaky naanị nri, gịnị mere gọomentị ekwenyebeghi n'ụgwọ opekatampe ọhụrụ a chọrọ ka ha kwụọ? Mana ndị ntaakụkọ Oak TV bụ ndị akụkọ a si n'aka ha pụta na mbụ, wepụtara akwụkwọ ha ji rịọ mgbaghara, ma kwuo na ọ bụ mmehie ka ha mere. Gụọ uche obi ndị mmadụ ka ha kwuru maka ya na Facebook BBC Igbo: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49080547,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49080547,Precious Owolabi: Ihe 'Channels' kwuru maka ọnwụ Precious,Ụlọọrụ Channels Television ekwuola na Precious Owolabi onye bịara ife ala nna ya (NYSC) bụ nduje ka o dujere onyentakụkọ ha gara ime isete ngaghariwe ndị shiites n'ụbọchị Mọndei.,"Precious Owolabi gara ife ala nna ya n'ụlọọrụ Channels Kingsley Uranta bụ onye so na ndị isi ụlọọrụ ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbọ tụgburu Owolabi mgbe ndị Shiite na-eme ngaghariwe. BBC Igbo jụrụ ya ma ụlọọrụ ha enyekwara onye ntakụkọ ahụ ọzụzụ zuruoke maka ị gaa isetee ụdịri akụkọ yiri nke ngagharịiwe Shiites, Uranta kwuru na ọ bụ ya na onye ntakụkọ ha kwụ gaa. Anyị jụkwara ya ma Owolabi na onye ntaakụkọ ha eyikwa uwe nchekwa ndị ntakụkọ na-eyi were gaa isete ya bụ akụkọ , Uranta kwuru na ọ gaghị azali ajụjụ ahụ ugbua. Ekwenti nyụrụ ka ọ na-aza anyị ajụjụ ndị a mana ọ kpọghachiri kwuo na ọ gaghị azachịghali anyị ajụjụ niile a kama ọ ga-ebipute akwụkwọ ozi ihe ụlọọrụ Channels nwere ikwu gbasara ọnwụ Owolabi. Ụgboro ole ka ndị ntaakụkọ Channels bara n'ọdachị n'ebe ha na-esete akụkọ? Enenche Akogwu bụ onye ntaakụkọ ha nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara na Kano n'afọ 2012. Ndị ọra ọbara were mma sụgbuo Charles Erukaa mgbe ọ gara isete ọsọ nta vootu pati APC na Rivers state n'afọ 2015. Etu ọ dị ugbua onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị ezinụlọ Precious Owolabi nakwa onye uweojii Usman Umar nwụrụ n'ọdachị ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43352924,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43352924,Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị,"Nrị dị nma, ịchọ nma, ego, ezumike, ụmụaka, alụmdinanwunye, mmekọrịta ha na enyi ha...ihe masịrị ụmụnwaanyị karịrị akarị.","Ọtụtụ ihe na-amasị ụmụnwaanyị Mana ugbua anyị ga-akọrọ unu ihe ise kachasị amasị ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị Igbo: Ha anaghị eji ụmụ ha egwu egwu makana ezinaụlọ ha dị oke mkpa. Ụmụaka ha bụ ihe mbụ na ndụ ha. Ụmụnwaanyị ala Igbo bụ oriakụ na-achọ ebe ahụ ga-adị ha mma ""Ahụ chọrọ nhicha"" ụmụnwaanyị adịghị achọ mmekpa ahụ. Ha chọrọ ka ha kee ekike dị mma Ụmụnwaanyị Igbo na-eji ejiji dị mma ọge ọbụla. Ụmụnwaanyị ala Igbo na-achọ ụmụnwoke na-agba mbọ Ihe ọbụla nwoke tinyere aka na ya, nwaanyị Igbo ga-akwado ya. Ha na-achọ itinye aka n'ọrụ oge ọbụla, ha anaghị achọ ịnọ nkịtị Ihe niile nwaanyị chọtara ime, ọ ga-eme ya ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51132544,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132544,Fr Mbaka: Ọ ginị mere ude ụkọchukwu a ji ede?,"Otu onye a kpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa bụ ụkọchụkwụ ụka Katọlik bụ Fada Ejike Mbaka nke ọgbakọ ekpere ""Adoration Ministries"" di n'Enugwu.","Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ihe Fada Mbaka mere na-ewu bụ amụma o buru maka mmeri Hope Uzodinma meriri n'Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa iji bụrụ aka na-achị Imo steeti. N'ụka ọ kara na ngwụcha ọnwa Decemba eji gafeta ụbọchị mbụ nke Jenụwarị 2020, Mbaka kwuru na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020. O kwukwara na ""Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri"" maka na Hope Uzodimma ga-ewere ọchịchị dịka gọvanọ steeti ahụ. Content is not available End of Facebook post, 1 Ka amụma a Mbaka buru pụtara ihe, soshal midia nwuuru ọkụ dịka ọtụtụ mmadụ, ọkachasi ndị na-akwado aka na-achi Imo n'oge ahụ bụ Emeka Ihedioha, gbarụru ihu maka amụma ya. Onye na-eti egwu a ma ama bụ Charly Boy nakwa onye na-eme ejiji bụ Charles Awurum sokwa na ndị bara ezigbote mba maka okwu Mbaka. Isiokwu ndị a na-akpo Mbaka aha bụ na amụma ya banyere Imo bụ amụma ụgha. Mana ka chị jiri n'ụbọchị iri na ano nke ọnwa Janụwarị 2020, Ụlọikpe Ukwu na Naịjirịa nyere Hope Uzodinma ikike ị bụrụ aka na-achị Imo steeti. Tupu Ụlọikpe Ukwu ekpee ikpe ahụ, onye a kpụ n'ọnụ bụ Mbaka, ka ụfọdụ na-asị na mkpebi ụlọikpe a ga-egosi ụdịrị amụma ọ na-ebu. Ebe ụfọdụ, dịka nwa amadị e ji Henry Shield mara na Twitter, na-ekwu na ọ bụ ozi ka e ziri Mbaka ka ọ mata etu ndi mmadu ga-esi wee nabata mkpebi ulọikpe ahụ. Ka mkpebi a ruru ala, ụfọdụ na-ekwuzi na o gosiri na Mbaka na ndị na-achị Naịjirịa na-arụkọ, dịka ndi ọzo na-ekwu na ọ bụ ihe gosiri na o bụ ụkọchukwu ọpụrụiche. Ọkaiwu Chima Anozie bụ onye Imo steeti ma sokwara zuo ndọrọndọro onye ga-ebu ọkọlọtọ APC na ntuliaka nke 2019 kwenyere n'aka Mbaka dị na mmeri ha nwetara. N'okwu o kwuru ka ụlọikpe kpebiri ikpe, ọkaiwu a sị na ka Mbaka buchara amụma ya, ya weputere ihe o ji ekpe ekpere were kpokuwe Chukwu. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik anaghị akwado Mbaka 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere' Onyeisi ụka katọlik na Legọs kwuru na amụma Mbaka adabaghị n'etu Ụka Katọlik si eme. Bishọp Adewale Martins gwara BBC na ọ bụghị ihe ziri ezi etu Mbaka si akwado otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị hapụ onye nke ọzọ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na e nwere ike ịkwụsị ọgbakọ ekpere Mbaka ma ọ bụrụ na ọ kpachapụghị anya. Mana ọtutụ ndị nkwado Mbaka na-ekwusi ike na Chineke ji ya arụ ọrụ." afirika-49631018,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49631018,Land Dispute: Esemokwu ala ka na-ata isi ndị mmadu n'Ebonyi,Oke igbu mmadụ n'obodo ndị gbara gburugburu n'okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi steeti anaghị atọ ọchị.,"Ozu mmadụ asatọ ka e butere n'obodo Ngbo n'ụbọchị Satọdee bụ ndị amabeghi onye maọbụ ndị gburu ha. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odah gwara BBC Igbo na a na-eche na ọbụ esemokwu ihe gbasara ala kpatara ọnwụ ndị ahụ. Odah kwuru na n'ime mmadụ asatọ ahụ e gburu, anọ ka e bepuru isi, ebe ndị ọzọ gụnyere ụmụ otu n'ime ha dị naanị afọ ise. Aha ndị e bepuru isi bụ: James Aneke onye gbara afọ iri ise na atọ, Innocent Agbo, Chukwu Enwe na Livinus Idoko. Ndị ọzọ: Ngozi Ibeni, Jonathan Onwe onye gbara afọ iri, Susan gbara afọ ise na otu onye ọzọ. Otu onye aha ya bụ Nwankwọ ka nọ ọdị ndụ ọnwụ ka mma n'ụlọọgwụ dịka Odah si kwu. Gini na-akpata oke ogbugbu ndịa? Odah kwuru na enwere otu mpaghara ala a na-azọ n'etiti obodo abụọ, otu bụ ndị Ebonyi Steeti, nke ọzọ bụ ndị Benue steeti. O kwuru sị: ""Mgbe ikpeazụ e gburu mmadụ bụ ndị gara n'ala ahụ a na-azọ azọ ịkọ ugbo."" ""Anyị adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ghara ịrụzi ọrụ ugbo n'ala ahụ ganye na ekpezichaa esemokwu."" ""Mana nke ugbu a bụ na ndị ahụ gafetere ma bata n'ime obodo gbukpọọ ndị mmadụ."" Odah kwukwara na-amaghị ma ndị ji akụkụ ahụ mmadụ agwọ ọgwụ ọjọọ etinyekwuola aka n'igbu ndị mmadụ n'okirkiri ahụ. Nke a bụ maka na ụfọ ndị ahụ e gburu egbu, akụkụ ahụ ha ụfọdụ adịghịzi ya. Olee mgbe okwu ala malitere? Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Ndị uweojii kwuru na okwu ahụ malitere ọtụtụ afọ gara aga. Loveth kọwara etu nwanyị obodo Ohaukwu gbarala afọ iri itoolu siri kwuo na ọgụ ahụ malitere tupu amụọ ya. ""Ọ bụ ihe anya mmiri na ihe dị otua ka na-eme n'ọgbara ọhụrụ a a kpọrọ ""21st century"". Gịnị ka ndị uweojii na-eme? Dịka Loveth sị kwuo, Kọmishọna ndị uweojii na Ebonyi steeti bụ Awosola Awotunde agaalarị njem nleta n'ebe ahụ ihe a mere. Awotunde kwere nkwa na ya na ndị isi na-elekọta mpaghara ""zone 4"", Larmode Titus, nakwa nke ""zone 6"", Musa Kimo, ga agbakọ aka wee rụọ ya bụ ọrụ. Ngalaba ""zone 4"" nke ndị uweojii gụnyere Benue, Nasarawa nakwa Plateru steeti, ebe ""zone 6"" gunyere Akwa-ibom, Cross River, Rivers na Ebonyi. Loveth kọwara na mpaghara a na-azọ azọ buru oke ibu nke mere na naanị ndị uweojii nọ n'Ebonyi steeti agaghị echekwata ya nke ọma. Ọtụtụ steeti gbara Ebonyị gburgburu nke mere ka okwu ala na-adapụtakarị kwa mgbe kwa mgbe. Steeti ndị a gụnyere Benue, Cross River, Abia na Enugu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo" afirika-49458013,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49458013,Nwa Regina Mba egburu n'Enugwu ekwuola na obara nne ya ga-abọrịrị ọbọ,Ndị Obodo Nchatancha Nike n'Enugwu steeti ka na akwarịrị akwa arịrị maka nwa nne ha nwaanyị bụ Regina Mba egburu n'ugbo ya.,"Amuche Anike, nwa Regina Mba egburu n'Enugwu Ọ bụ akpụ ka ọ gara ịbuta n'ugbo ya mgbe nke a mere n'abalị abụọ gara aga. Nwa ya nwaanyị bụ Amuche Anike ji nnukwu anya mmiri wee kwuo na ọbara nne ya agaghị ezuriri ike ganye na ndị niile gburu ya abanye n'ala dịka ya onwe ya. Amuche onye nọ na azachasị ụlọ nne ya nwụrụ anwụ kọwara na abalị abụọ gara aga ka ndị agbata obi kpọrọ ya na-ekwe ntị n'abali na nne ya gara ugbo ka mgbe ụtụtụ alọtabeghị. Evelyn Oko, Nwunye dị Regina Mba egburu egbu Nke a mere ojiri si be dị ya bịa na be nna ya soro ndị obodo banye ime ọhịa chọbazịa mama ya. Amuche kwuru na ọbụzị na ụtụtụ tọzde ka a hụzịrị ọzụ nwaanyị ajadụ ahụ ebe agbara ya atọ, were mma berisia ya dịka e sị ebe anụ. Ya bụ iheịgba anya mmiri kpatazịrị ụmụ ikorobịa ndị Nchatancha nakwa agbataobi ha niile jiri mee ngaghariwe ụbọchi ahụ were gbachie okporo ụzọ awara awara sị Enugwu gaa Abakaliki. Pastọ Nick Ugwu, nwanne Regina Mba egburu egbu N'ahịa Nchatancha Nike a na-akpọ ọnụ ọgba, ebe niile nọ na iru ujun'ihi na ha amatebeghị ndị kpara ya bụ arụ n'ọhịa be ha. Nwanne nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ, otu nne otu nna ya bụ Pastọ Nick Ugwu ji anya mmiri kwuo na ọ bụ Chukwu ga abọrọ ha ọbọ na-aka ndị gburu nwanne ya nwaanyị na-eleghị anya na-azụ. Ndị Uweojii Enugwu ewepụtalarịị ozi site n'ọnụ onye nkwuchitere ha bụ DSP Ebere Amaraizu sị na ọ bụ eziokwu na ebutere ozu nwaanyị ajadụ ahụ n'ugbo ya na nchatancha Nike, Ha kwukwara na ndị uweojii na atinyezị anya na mmiri ugbua ịchọpụta ma jide ndị merụrụ ala ahụ." afirika-52133654,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52133654,Covid-19 Ventilator: Kedụ ihe ọ pụtara na ihe mere eji achọ ya maka ọgwụgwọ coronavirus,"Kamgbe ọrịa covid 19 bidoro kpawa ike n'akụkụ ụwa niile, otu okwu a na-anụkarị n'ọnụ ndị isi mba dị iche iche bụ ""Ventilator.""","Ndị ọrịa coronavirus ji na njọ nwereike ịgbanahụ ọnwụ maọbụrụ na ejiri ventilator nye ha ọgwụgwọ. Mana gịnị bụ ventilator nakwa ihe ọ na-arụ? Ventilator bụ akụrụngwa na-enyere onye ngụgụ ya anaghị arụ ọrụ ọfụma aka i kute ume. Nke a ga-enyere onye ahụ aka ị buso nje ahụ mebiri ngụgụ ya agha ma gbakee. Ọ dị na ụdị na ụdị. E nwere nke ji ikuku si n'ahụ mmadụ arụ ọrụ nke ga-esi na tubu akwụnyere n'imi maọbụ ọnụ mmadụ agafe. Nke abụọ gụnyere naanị ikwụnye mask n'imi na ọnụ onye ahụ, onweghị tubu ga-adị ya. ""Ventilation"" ọbụla kwesiri inwe onye ga-anọ n'akụkụ ileta onye akwụnyere ya. Kedụ ihe mere ventilator ji dị mkpa? Innocent Chukwuma Ụlọọrụ World Health Organization (WHO) na-eche na mmadụ ruru pasenti 80 nwereike isi n'ọrịa coronavirus gbakee ọ bụrụgodị na ha agaghị ụlọ ọgwụ. Mana akụrụngwa ventilator na-azọ ndụ ndị ọnọdụ ha gụnyere ekughị ume ọfụma makana o ga-enye aka webata ikuku ga-eme ka ha ghara ikubi, nwụọ. Ndị na-enweghị ọnọdụ nọketere ọnwụ nwereike iji ventilator gụnyere maskị ihu, nke imi maọbụ nke ọnụ nwereike ibuba ikuku na ngụgụ. Dr Shondipon Laha nke 'Intensive Care Society,' na-ekwu na ọ dị mma ka ndị ma anya ventilator bụrụ ndị ga na-eji ya ilekọta ndị ọrịa a na-arịa. Nke a bụ makana ọ bụrụ na e tinyeghị ya bụ akụrụngwa ọfụma, o nwereike imerụ onye etinyere ya ahụ nke ukwu. Ka ọ dị ugbua mba dị iche iche na-agbalị ka ha zụta ventilator maka ndị mba ha ọrịa nwereike ibutu n'ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus" afirika-43704211,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43704211,Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra,"N'ụbọchị taa, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwupụtala obi ya ị zọ ọkwa ọchịchị ọzọ n'afọ 2019.","Onweghị onye nụrụla olu onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kamgbe ọnwa Seputemba, afọ 2017. Nkwupụta ya butere ọtụtụ ọsịịsa site n'ọnụ ndị mmadụ dị icheiche, ụfọdụ bụ ndị katọọrọ ya dịka ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ihe o kwesiri i mee. Mgbe BBC Igbo gbara Ụkọchukwu Innocent Chukwudi Peace bụ onyeisi mgbasa ozi otu chọrọ nwereonwe na Naịjirịa bụ Ipob ngalaba dị n'Abuja ajụjụ ọnụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: O kwuru na ọ bụ ihe ọṅụ nye ndị Ipob n'ihi na Chineke ji ọchịchị Buhari e mee ka nwereonwe Biafra bịa na mmezu. O kwuru na ọ bụrụ onye ọzọ na-akpọghị ndị Igbo asị dịka Buhari bara n'ọchịchị, onye ahụ nwereike i mee ka obi daa jụọ ndị Igbo nke ga-eme ka ndị Igbo chefuo na ha bụ ohu na Naịjirịa. Peace kwuru ""Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ""Pharoah"" ahụ ga-anọ n'ọchịchị gaa n'ihu, dịka Obasanjo kwuru na Naịjirịa ga-ekewa ma ọ bụrụ na Buhari baa n'ọchịchị."" ""Ekpere anyị n'ụtụtụ, ihihie na abalị bụ ka Naịjirịa gbasa sịa"" Peace kwuru. Gere okwu ụkọchukwu Peace ebe a; Ụkọchuku Peace: Chịneke ga-eji Buhari wetara anyị Biafra" afirika-44027326,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44027326,Legos: Ụmụnwaanyị dị ime 2131 na-arịa HIV,Opekata mpe ihe ruru ụmụmnwaanyi dị ime karịrị puku abụọ na-arịa ọrịa HI nke a kpọrọ HIV na bekee.,"Kọmishọna ahụike na Legos steeti bụ Dkta Jide Idris kwupụtara nke a na nsonso na mkparịtaụka ya na ndị ọrụ ntaakụkọ na nsonso a. Idris kwuru na n'ime ụmụnwaanyi dị ime dị 38,791 e nyochara n'afọ 2017 maka ọrịa ahụ, 2,131 nwere yabụ ọrịa. ""Opekata mpe, ụmụnwaanyị dị 38,791 dị ime matara ọnọdụ ha , ebe e tintyere ihe dịka 2,131 ndị a chọpụtara nwere orinchekwaahụ na atụmatụ igbochi nne inye nwa ọrịa orinchekwaahụ."" O kwuru na emere nyocha ahụ site na ego enyemaka si n'aka otu na-agba mbọ maka ibelata mgbasa ọrịa mminwụ (AIDS) bụ Global Fund. Idris kwuru na nkwado ahụ nke ha jiri mee ntule atụmatụ ahụ bido n'ọnwa Janụwarị rue Disemba, afọ 2017 na Global Fund wetara USD9,623,390.08 maka iji zụọ ọgwụ na ihe nnyemaka maka ndị na arịa ọrịa orinchekwaahụ, ime nchọpụta n'ọkpụrụ ọchịchị atọ dị na steeti ahụ , ebe Legos steeti wetara otụ n'ụzọ iri ego ahụ. Ọ gara n'ihu kọwa na ka ha mepụtachara atụmatụ ahụ, mmadụ dị 26,768 persons (+15yrs ruola afọ iri na ise ha narala ndụmọdụ nakwa nyocha ma ha e nwere ọrịa orinchekwa ahụ, ebe e tinyerela 10,623 n'atụmatụ ịnara ọgwụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54049830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54049830,'Ọ bụ okwu mmekọ nwoke na nwoke n'etiti ndị ụkọchukwu butere esemokwu n'ụlọụka Anglịkan dị n'Ezinifite',"Dịka ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe kpatara ndị Ezinifite jiri gbachie ụlọụka Immanuel dị na be ha ụbọchị ụka, ọnụ na-ekwuru Dayosis Anglican nke Aguata agwala BBC ebe mmiri siri banye n'akụ oyibo.","Ihe mere eji chụọ ụkọchukwu ụlọụka Anglican n'Ezinifite - Aguata Dyosis Abụchị Nwozor sị na okwu ahụ malitere kemgbe afọ 2017 oge Dayosis ahụ mechara nnyocha were chụọ ụfọdụ ụkọchụkwu ""makana ha na-edina nwoke ibe ha."" ""Ihe meziri bụ na Ụkọchukwu na-ahụ maka Ezinifite, bụ Venerable Emma Ekejiuba, gara ebe a na-akwa ozu were kwuo na otu n'ime ndị a achụrụ enweghị ihe o mere were kpụọ ya ka o soro ya kpee ekpere."" Ọ sị na agwa Ụkọchukwu Ekejiuba kpara site ịkpọghachi onye achụrụ n'ọrụ ụkọchukwu ma kwuo na onweghi ih e o mere megidere iwu ndị Anglican na Naịjirịa. Maazị Nwozor gakwara n'ihu kwuo na aka Bishop Aguata bụ Samuel Ezeofor adịghị n'ihe mere karịcha na ọ bụ ya nyere Ven Ekejiuba ezumike nwagbenta. Ọ sị, dịka Bishop Ezeofor nụrụ ihe Ven Ekejiuba mere, ọ hibere kọmịtị maka nyocha ka a mata nke bụ eziokwu, mana ọ gọrọ. Ka emechara, a chọpụtara nọ ọ bụ eziokwu makana ihe o kwuru dị na ""tape"". Maazị Nwofor gakwara n'ihu kwuo na ya bụ obodo adaala jii dịka ụfọdụ ndị so mee nsogbu ụbọchị ụka na abịa ịrịọ mgbaghara. Ihe a Maazị Nwozor kwuru dabanyere n'ihe otu ụkọchukwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC n'ụbọchị Sọnde bụ ihe mere ndị ntoroọbịa Ezinifite ji were igodo gbachie ụlọụka Immanuel dị n'obodo ha. BBC kpọrọ Ụkọchukwu Ekejiuba ka anụta ọnụ ya o were sị ka akpọghachi ya. Mana oge eji kpọghachi ya, ekwentị ya anaghịzị aga. Kedụ ihe mere e ji kwụsị Archdeacon a ọrụ? Ụkọchukwu a sị na e nwere otu ụkọchukwu bụ nwafọ Ezinifite a chụrụ maka ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke n'afọ ole na ole gara aga. Onye Archdeacon a gara akwamozu ma hụụ ụkọchukwu a, sị ya kpee ekpere gọzịe nri n'akwamozu ahụ. Mana iwu ndị ụka Anglican megidere onye ụkọchukwu a chụrụ achụ ịrụ ọrụ n'ụdị ọbụla, nke mere mgbe ozi ruru Bishọp ntị na ọ gbarụrụ ihu. Bishọp gara n'ihu kwụsịtụ Archdeacon a ọrụ n'ihi agwa ọ kpara ma zigaa onye ọzọ n'Ezinifite ka ọ nọchite anya ya na nchere oge. Ụfọdụ ndị ntoroọbịa Ezinifite anabataghị ya nke mere ha ji gbachie ụlọụka sị ka a kpọchịrị ha Archdeacon a kwụsịtụrụ ọrụ. BBC Igbo kpọrọ Bishop Samuel Ezeofor n'ekwentị ka a mata etu eke si anya anwụ maka ọ zabeghi rute ugbua akụkọ na-apụta. Cheta na ihe onyonyo na-efegharịnụ na soshal midia gosiri ka ndị ụlọụka Emmanuel Anglican Church Ezinifite dị n'Anambra steeti na-eme ngagharịiwe. O gosiri ebe ọtụtụ mmadụ kwụ n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ na-ekwusike na ha achọghị ka archdeaconry ọhụrụ ewetere ha bata n'ụlọụka ha kama ka ewetere ha nke ochie ka pụchara tupu nke ọhụrụ a abata. Nke a mere ka ha were akwụkwọ e dere ""Uzọ anyị mechiri emechi"" madocha n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ ka aghara ịka ụka taa ebe ahụ." afirika-50445943,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445943,Father's Day: Ihe ise ị ga-emenwuru ụmụnwoke nọ na ndụ gị taa,"Ị ma ihe ndị ị ga-emenwuru nna, di, enyi nwoke, deede maọbụ enyi gị nwoke taa?","Genevieve Nnaji bụ ome ejije Nollywood na nna ya BBC Igbo chọrọ inyere gị aka gwa gị ihe ndị ị ga-ejinwu mee ha obi aṅụrị n'ọdịniihu. Ọtụtụ oge ka ụmụnwoke na-ekwu sị ""oge niile ka ọ bụ ụmụnwaanyị ka a na-akwanyere ugwu. Gịnịkwanụ ka a na-emere ụmụnwoke iche?"" Taa bụ ụbọchị ncheta ndị nna, lee ihe ndị ị ga-emere ha na ụmụnwoke ndị ọzọ nọ na ndụ gị. 1) Kwụọrọ ya ụgwọ nri: Ọrịa coronavirus achụbala onye ọbụla n'ime ụlọ mana o kwesịghị ịkwụsị gị n'imere nna, di, nwanne maọbụ enyi gị nwoke ihe ọma taa. Ọ bụrụ na gọọmentị amachighi ịnọ n'ụlọ oriri na nkwari eri nri ugbua, agaara m asị gị kpọrọ ha gaa ebe a na-ere nri nke Bekee kpọrọ ""fast food joint/restaurant"", zụọrọ ya nri ma kwụọ ụgwọ ya. Mana nke ahụ akwụsịla gị o, n'ihi na ị nwere ike ""ịtụ order"" ka onye ọzọ sie nri dịka nri emume pụrụ iche, butere naanị ya. Ihe dịka nke Bekee kpọrọ ""Breakfast in bed"" na-aga ahịa n'ụdịrị ụbọchị a. Ndị mmadụ na-erezi nke a kpọrọ ""food tray"" maka ụbọchị dị etu a Makana ụfọdụ oge ka ụmụnwoke na-ekwukarị na oge ọbụla naanị ha na-azụrụ ụmụnwaanyị ihe, mana ị kwụọ ụgwọ nri ahụ, ọ ga-atụ ya n'anya. Ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ order nri, zụta ngwanri ị ga-eji esiri ya nri ọ kacha hụ n'anya. 2) Were 'ihe nsori' merụọ ya ahụ: Nke a bụkwa naanị maka ndị lụrụla di oo ;-) Iji sị ya na ọ gbalịala ma sị ya na ihe ọ na-eme na-amasị gị kwa mgbe, nabata ya ma ọ lọta ma gosi ya na ị chere ya eche. Gaa n'ihu nye ya n'ụdị ị na-enyetubeghi ya mbụ, nke ga-eme ka ọ ghara ichefu ụbọchị a echefu. 3) Tinye ego n'akpa ha: Ma ị na-arụ ọrụ ma ị naghị arụ, chọọrọ ya nwaobere ihe, nke ga-eme ya obi aṅụrị. Sị ya ""mpa m; di m; enyi m nwoke; nwanne m nwoke; deede m; ngwa were nke a tinye mmanụ n'ụgbọala gị, were nke a tinye ego n'ekwentị gị maọbụ were nke a gbaa ụgbọala ruo ebe ị na-aga"". Ọ gaghị echefu ụbọchị a echefu ma ị mee ya, makana ọ ga-abịa dịka ihe ọ na-atụwaghị anya. 4) Deere ya akwụkwọ ozi: Nke a abụghị iji zie ya ozi mgbakasị ahụ, kama ọ bụ ebe ị ga-agwa ya ihe niile ọ na-emeta ebe ị nọ. Ọ bụrụ di gị, gwa ya etu o si elekọta gị na ụmụ gị na etu o si emetụta gị n'obi, ọ bụrụ nna gị, kelee ya maka etu o si zụlite gị nakwa ihe ndị ị mụtara n'aka ya nakwa ihe ọma ọ na-emere gị. Gwa ya ihe ndị ọ na-eme na-amasị gị na etu o si eme ka ndụ tọọ gị ụtọ. Gwa ya na ị hụrụ ya n'anya, na ọ bụghị itu ọnụ. I nwekwara ike iji ekwentị gị zie ozi a, mana nke e dere n'akwụkwọ nwere ike ịka mma n'ihi na ọ ga-adị ka ""love nwantịntị"". 5) Nye ya ohere: Anyị asịghịkwa gị kwapụrụ ya n'ụlọ oo. Ihe anyị na-ekwu bụ gị nye ya ohere ka ya na ndị enyi ya nọkọọ ma nwee aṅụrị. Ọ bụrụ na ị na-eleburu ya elekere ma ọ pụọ apụ (ya bụ na ị na-enyo ma ọ lọtara n'oge maọbụ ọ lọtaghị), hapụrụ ya ka ya na ụmụnwoke ibe ya mee naanị ụdịrị ihe na-amasị ha taa. Ị hụlanụ na ihe ise ndị a agaghị efu gị oke ego, mana ọ ga-eme ka nwoke ahụ nọ na ndụ gị ghọta na ị hụrụ ya n'anya. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'" media-47211902,https://www.bbc.com/igbo/media-47211902,Nigeria Election 2019:: E meela APC taa kpuchie ọnụ na steeti ahụ,Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akachapụla ikpe arịrịọ ndị otu APC dị na steeti Rivers gbasara ntuliaka 2019.,Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Otu APC na steeti ahụ nke minista na-ahụ maka njem mara n'ụlọikpe ukwu aka dị na Rivers maka etu ha si kwụsị Pati ha ịwepụta ndị ga-anọchite anya ha na ntuliaka na-abịanụ. Nkpebi ụlọikpe ukwu gbadoro ụkwụ na mkpesa otu APC nke Magnus Abe na-achị kpesara ya. Abe kwuru ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka imeụlọ ndị otu APC Amaechi hibere mere. The Independent National Electoral Commission (INEC) gbadoro ụkwụ na nkpebi ụlọikpe ọkachasị wee hapụ ikpọpụta aha onye ọbụla si pati APC isonye na ntuliaka na-abịanụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-48582997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48582997,9th Assembly Inauguration: Ndị nwereike ịpụta dịka ndị isi Ụlọomeiwu,"Ihe niile gaa etu esi tụọ anya, a ga-ehiwe Ụlọomeiwu nke itoolu ma họpụta onyeisi Sịnetị nakwa nke ụlọomeiwu nta n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun.","Ahmed Lawan, Ali Ndume, Danjuma Goje, Orji Uzor Kalu all of dem fit dey eye di seat N'Ụlọomeiwu ukwu, a ga-ahọpụta onyeisi na osote ya bụ nke Bekee na-akpọ ""Senate President"" na ""Deputy Senate President"". N'Ụlọomeiwu nta a ga-ahọpụta onyeisi na osote ya nke Bekee kpọrọ ""Speaker"" na ""Deputy Speaker"". Ndị a ga-ahọpụta ga-anọ afọ anọ - ma ya bụrụ na-achụtughi ha - bụ oge ha ga na-ahazi ụlọomeiwu abụọ ahụ. Ụlọomeiwu nke asatọ, bụ nke Bukola Saraki na Yakubu Dogara nọ n'isi ya bụ nke mbụ patị na-anọghị n'ọchịchị (PDP) wepụtara osote onyeisi - Ike Ekweremadu rụrụ ọrụ dịka onye Bekee kpọrọ ""Deputy Senate President"". Ọnọdụ ahụ pụtara dịka ọtụtụ mmadụ na-echeghi - site n'adịghị n'otu n'etiti pati na-achị bụ APC mgbe e mere nhọpụta nke afọ 2015. Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari Mgbe ahụ, n'ụtụtụ a ga-eme nhọpụta ndị isi, ụfọdụ ndị omeiwu APC - ma ndị so azọ ọchịchị - gara nzukọ a sị onyeisiala kpọrọ ha, tupu ha apụta, Saraki na ụfọdụ ndị APC ndị ọzọ na ndị omeiwu PDP emeela ntuliaka iji họpụta ya na Ikweremadu dịka ndị isi Ụlọomeiwu asatọ. Ọ bụ Lawan ka APC họpụtaburu ịchị Sịnetị n'afọ 2015. Ugbua, ndị APC adịghị ka ndị chọrọ ka ụdịrị ihe ahụ mee ha ọzọ. Ha na-agbalị ịhụ na ha kwekọrịtara n'onwe ha tupu a pụta n'ụbọchị ntuliaka. Ndị na-azọ oche Sinetị Ahmed Lawan Na Sịnetị, ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisi dị n'etiti Ahmed Lawan, bụ onye bụbụ onyeisi patị na-achị n'Ụlọomeiwu ka rụchara ọrụ, na onye ọ naara ọchịchị n'aka bụ Ali Ndume. N'izuụka gara aga Danjuma Goje so na-azọ ọchịchị a wụsara ọwa dịka Onyeisisala Muhammadu Buhari tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Ihe Buhari mere na-egosi na ọ chọghị ka ihe mere n'afọ 2015 mee n'ọgbọ a. Agbanyeghị na Onyeisiala Buhari, APC na ụfọdụ ndị PDP na-akwado Ahmed Lawan, Ali Ndume sị na ọ gwụla ma e meriri ya bụ na ọ kwụsị ịzo ọkwa a. Mkpebi ya na-ada ka nke Bukola Saraki mere n'afọ 2015, nke mechara ga ka o si chọọ ya. Kedu ndị chọrọ ịbụ osote? Dịka mmadụ abụọ a na-achịpụ ya, oche onye ga-abụ osote onyeisi na Sịnetị nọkwa na ndọrọndọrọ. Ndị a na-anụ aha ha na nke a bụ aka chịbụrụ Abia Steeti bu Orji Uzo Kalu - bụ onye tozuru ọchịchị n'Ụlọomeiwu dịka oso n'Ụlọomeiwu nke ọchịchị ndị nkịtị akpọrọ 3rd Republic na-Bekee - na Ovie Ome-Agege nakwa Kabiru Gaya. Ọ bụ Ome-Agege ka eboro mmaburu eme ikike ndịomeiwu n'afọ 2018 Akuko na-ekwu na ndị APC na-akwado Omo-Agege na ndọrọndọrọ ọchịchị a. Ndị na-azọ oche Ụlọomeiwu nke obele N'Ụlọmeiwu nta, ọ bụ Femi Gbajabiamila ka APC kwadoro ka ọ bụrụ onyeisi ndị Ụlọomeiwu nta n'afọ 2015, tupu Yakubu Dogara e rite ya site na nhazi ya na ndị PDP. Ugbua, ọ bụ kwa ya ka ndị APC kwụ n'azụ n'agbanyeghi na Mohammed Bago si Naịja Steeti na John Dyegh si Benue Steeti so na ndị na-ama ya aka n'ihụ. Akukọ na-ekwu na Nkeiruka Onyejocha si Abịa Steeti adịghị azọzi ọkwa ahụ mana ọ dị ka Segun Odebunmi; Emeka Nwajiuba na Olajide Olatubosun ka nọ na ya bụ ndọrọndọrọ. Onye APC họpụtara dịka onye a ga-akwado make osote onyeisi n'Ụlọomeiwu nta bụ Idris Wase bụ onye na-anọchịteanya mpaghara Wase dị na Platu steeti. Usoro nhọpụta ndị isi Ụlọomeiwu Ukwu Ndịomeiwu niile tozuru ịzọ oche ndị a, mana usoro ha kpọrọ ""Standing Order"" na Bekee sị na ọ bụ site na ndị tọkachara ka a ga-enye ọchịchị. N'usoro a sị: ""Nhọpụta ndị Sịnetọ ga-abụ ndị isi n'usoro ọbụla ga-esite na ọtụtọ n'ụdịrị a: (I) Ndịomeiwu na-alaghachite site n'ugboro ole ha meriri ndọrọndọrọ; (ii) Ndịomeiwu ukwu nọ bu nke obere; (iii) Ndịomeiwu batara ọhụrụ. Nke a pụtara na ndị nọbụ n'Ụlọomeiwu na-enwete ohere kara ndị ọzọ bịara ọhụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45637258,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45637258,God is Good Motors: Ntọ ha tọrọ ndị njem anyị abụghị ihe atụwara anya,Ndị ụlọọrụ ụgbọala God is Good Motors ekwuola na ha atụghị anya cha cha na ndị ntọ ga-atọrọ ndị so ụgbọala ha eme njem.,"God is Good bu ndị ọrụ ụgbọala ama ama n'ala Igbo Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ ọkaikpe Paul gwara onye ntaakụkọ BBC na ọbụghị eziokwu na ndị ntọ a họpụtara ndị njem ha dịka ndị ha ga-atọ. Paul kwuru na ndị ntọ a wakporo ndị ọrụ ụgbọala atọ ọzọ n'otu mgbe ahụ. N'ọnụ okwu ya: ""Ụbọchị ahụ, a tọrọ mmadụ itoolu n'ụgbọala anyị mana atọghapụrụ mmadụ abụọ n'abalị ahụ"" Paul sị na aka ha ka ihe ekechiri ekechi maka ka ihe a na-eme ezinaụlọ ndị a tọrọ agwaghị ha ihe na-eme. Paul kwuru na ha agaghị enwe ike ikwusi ike ma ezinaụlọ ndị a tọrọ akwụrụ ego ntọghapụ makana onweghị ihe ọbụla ha gwara ndị ụlọọrụ ha. Ndị ụweojii ka na-ebuso ndị ntọ agha na steeti dị iche iche na Naịjirịa ""Anyị amaghị ma ha na ndị ntọ enwere nkwekọrịta ọbụla mana anyị nụrụ na onwere ụfọdụ n'ime ha kwụrụ ụgwọ ntọghapụ"" Ihe ga-eme n'ihu God is Good kwuru na ha ga-ahụ ma ha a ga-enwe ike ịkwụ ego ""insurance"" oge ọbụla ndị omekome tọrọ ndị ahịa ha. Mana egwu na-atụ Paul. O kwuru na: ""Ihe a nwere ike ibute nnukwu nsogbu makana ọ bụrụ na ndị ntọ mara na anyị na-akwụ ego ""insurance"" maka ntọ, ndị ntọ ga na-awakpo ndi njem anyị oge ọbụla"". O kwukwara na: ""Ọ dịzị n'aka ndị nche obodo makana ha ma na ebe ahụ dị n'etiti Ọre na Ọkada bụ ebe ndị ntọ kachasị awakpo ndị mmadụ."" Ihe ndị uweojii kwuru Femi Joseph bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Ondo steeti gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ntọ torọ ndị njem God is Good Motors mana ha ka na-enyocha ya bụ akpamike. Ọrụ ka na-aga Oge BBC Igbo gara ụlọọrụ God is Good Motors na Jibowu n'ime Legọs, ọrụ ka na-aga etu o si aga na mbụ. Mana ndị ọrụ ha gwara BBC Igbo na ha ma na ọtụtụ ndị mmadụ na-atụzị egwu maka ihe a mere mana ha ga na-aga n'ihu n'ọrụ ha n'agbanyeghi ihe a mere. God Is Good gbasakwara akwụkwọ ozi ebe ha kelere ndị uweojii maka mbọ ha gbara n'emume a, ma kwuo na ha chere ka akpọpụtachaa ndị atọrọ tupu ha edepụta akwụkwọ ozi ahụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47384002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47384002,Ndị ụlọozu South Africa chọrọ ịkpụpụ ụkọchukwu ụlọikpe maka 'ịkpọlite onye nwụrụ anwụ',Otu ndị ụlọozu nọ na mba Saụt Afrịka ekwuola na ha ga-akpụpụ otu nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchukwu ụlọikpe maka ikwu na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ.,"Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a Otu ihe nkiri e kesara ọfụma na soshal midia, gosiri ụkọchukwu Alph Lukau ka ọ na-agwa otu nwoke dina n'ime akpati ozu ""kunie"" , o kuliri ka ndị mmadụ malitere iti mkpu ọṅụ. Ndị ụlọozu ahụ kwuru na a ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye. Ọtụtu ndị mmadụ katọrọ ihe ""ịtụ n'anya"" ahụ mere n'ihu ụlọụka Lukau dị nso n'obodo Johannesburg, ebe ọtụtụ ji ya mere ihe ọchị. ""Anyị ekwenyeghị na e nwere ihe ọbụla dịka ihe iribama"", ka ngalaba na-ahụ maka omenaala, ofufe na asụsụ a kpọrọ ""(CRL Rights Commission)"" gwara ndị ntaakụkọ mba Saụt Afrịka. CRL kwuru sị ""Ha na-eji ihe iribama aghọgbu ndị mmadụ na-enweghi olileanya iji napụta ha ego"". Ha ghọgburu ụlọozu atọ Ụlọozu atọ sị na aghọgbụrụ ha na chandum a nọ na-achọzị ụzọ ha ga-eji mee ka ha hicha aha ha. Ụlọozu ndị a bụ Kingdom Blue, Kings & Queens na Black Phoenix agaala ụlọikpe ma kwuo na-eji ọtụtụ usoro ghọgbuo ha. Ụlọụka ụkọchukwu Lukau bụ Alleluia Ministries International, asabeghị ajuju BBC jụrụ ha banyere okwu a. Otu ụlọ ntaakụkọ akpọrọ Sowetan si na ulọụka ahụ ekwuagharịala okwu banyere mkpọlite n'ọnwụ ahụ, si no ọbụghị ihe mere, na nwoke ahụ ha sị nwụru anwụ ekụrịela tụpụ ebute ya n'ụloụka ha na obodo Kramerville. Sowetan sị na ulọụka ahụ sị: ""Pastor Lukau mezuru ihe ịrịbama Chukwu malitere,"" Ndị mmadụ na mba Saụt Afịrịka na-ekwu okwu maka ihe a mere ọfụma. Ọ nwekere ndị banyere soshal midia ji ya bụ ihe eme akaja." afirika-45293683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45293683,BIM: Ndigbo bịa kwụọnụ ụtụisi n'ụlọọrụ anyị,Ralph Uwazuruike bụ onye ndu ndị Biafra Independence Movement ekwupụtala atụmatụ ị na ụtụisi ndị Biafra nke afọ 2018.,"Uwazuruike, onye bụbu onye ndu Massob kwuru na ọ bụ atụmatụ a na-eme kwa afọ iji nweta nwereonwe Biafra n'ụzọ udo na-enweghi ọgbaghara ọbụla. Ozi a si n'aka onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Chris Anierobi Mocha bụ o zigara ndị akwụkwọ akụkọ Vanguard n'Owere. Uwazuruike gwara Ndigbo ka ha nwee mpako na ha si n'agbụrụ ndị Igbo nakwa ala Biafra pụta. Ọ gara n'ihu gwa ndị Igbo ka ha gaa n'isi ụlọọrụ ndị BIM dị icheiche dị ha nso ga kwụọ ụgwọ ụtụisi ha, nke o kwuru na ọ bụ onye o metụrụ n'obi. Uwazuruike kwuru na ọ na-ahụta mba ise ndị ọzọ ga-esi na Naịjirịa kewapụta, kwuo na ọ bụ nke a ga-akwụsị ntaramahụhụ na ọchịhchị ọjọo dị na Naịjirịa ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49021378,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49021378,Ebonyi state building collapse: Enweghi onye ụlọoriri dagidere - Ndị uweojii,Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha ka na-enyocha ihe butere ọdịda ụlọoriri Metro View n'abalị ụbọchị 17 nke Julaị 2019.,"Akụkọ kwuru na mmadụ ruru iri isii ghọgburu ọnwụ dịka ha gbalahụrụ ọdachi ahụ. Mana dịka Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, otu onye n'ime ndị na-achịkọta ụlọoriri ahụ gwara ha na ha hụrụ na ụlọ ahụ na-agbawa n'ime mkpụrụ ụbọchi ole na ole gara aga. Nke ahụ mere ka ha malite ịrụgharị ụlọ ahụ tupu o mechaa si ebe e si arụgharị ya daa. Odah kwukwara na enweghị otu mkpụrụ onye merụrụ ahụ maọbụ nwụọ n'ime ụlọ ahụ, makana mmadụ anọghị n'ime ya mgbe ọ dara. Ndị kwesịrị ịnọ n'ime ya gara nzukọ n'ime otu mpaghara ụlọoriri ahụ, mere ka ha gbalahụ ya bụ ọdachi. Ka a jụrụ ya maka ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ, o kwuru sị na ebe ahụ dara ada abụghị ebe ndị na-arụ n'ụlọoriri ahụ na-anọ. Odah jikwa ohere ahụ kwuo na ha na-akpọku ndị nwere ebe ọha na-agbakọ, gụnyere ụlọụka, ụlọakụ, ebe obibi nakwa ebe ndị ọzọ, ka ha gbaa mbọ hụ na ha ledoro ụlọ ha anya ọfụma. O kwuru na a gbapere ụlọoriri a n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee n'afọ 2005. Gịnị ga-eme ma e mechaa nyocha? Odah kwuru na ha mechaa nyocha, ha ga-esi n'ihe ha chọpụtara mara ihe a ga-eme ndị na-achịkọta ụlọoriri a. Nke a bụ ma ọ bụrụ na a chọta ihe n'aka ha. Lee ihe nkiri oge ụlọ dara n'Ọnicha Building collapse: Ụlọ elu adagbuola Injinịa na-arụ ya n'Onicha" afirika-51535538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51535538,Innoson: Anyị anaghị amanye ndị mmadụ ka ha zụọ ụgbọala anyị - Innocent Chukwuma,"Dịka akụkọ na-efegharị na ndị ụlọ ọmeiwu ukwu nke Naijirịa jụrụ ịnya ụgbọala nke emere na Naijirịa dịka ụgbọala ọrụ ha, ma sị na ọ bụ nke esi ala bekee bute ka ha chọrọ.","Akụkọ na-ekwu na ọ bụ na nzụkọ nke ha nwere n'ụbọchị ise nke ọnwa Febuarị afọ 2020 ka ha nwere mkpebi a. Ndị omeiwu a sị na ọ bụ ụgbọala Toyota Camry nke afọ 2020 ka ha chọrọ. Ndapụta a mere ka ndị mmadụ gaa na shọshal midia were kwupụta obi ha. Na aka n ke ọzọ ka ọnyeisi ụlọọrụ na emepụta ụgbọala na NAijirịa bụ Innocent chukwuma kwuru sị "" Ugbọala anyị na-arụ bụ onye chọọ, anyị eresi ya, ọnweghị onye anyị na amanye ga ọ zụọ ụgbọala anyị. Nke masịrị onye ya goro"". Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ O kwukwara sị na ha enweghị ikike ịmagide ndị ụloomeiwu ka ha zụo ụgbọala ha, were sị ""anyị na-arụ ka ọ dịrị ndị be anyị mma, nke anyị na arụ be anyị bụ nke ndị be anyị. Onye chọo kwa nke ndị oyibo ya ga goro"". Chukwuma sị na ọ bụ ụgbọala emere na Naijirịa ka ọ na-anya ma sị na ihe kpatara o jị anya ya bụ na; "" ọ na-atọ m ụto inya ya maka na ọ bụ na be anyị ka emere ya"". BBCIgbo kpọrọ onye na-ahu maka mgbasa ozi ndị ụlọomeiwu bụ Ben Kalu kama ọzaghi ekwe nti ya. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a Enigma kwuru sị na ọdịghị mma na ndị omeiwu na-amanye ndị mmadụ iri owkute sị na ọ bụ osikapa ma jụ ka ebunye ha ụgbọala Innoson. Vick sị ""ọ bụ gịnị mere ụgbọala Innoson? Ị gbachiri ịbụbata nrị ma ịmachịghị ibubata ụgbọala"" Success Adams sị "" A na-enye Innoson ntụrụugo na-erughị ya"" Akụko ga-amasị gị" media-43793001,https://www.bbc.com/igbo/media-43793001,"Ha anwụghị, ahụ ka ha merụrụ- Ndị uweojii Imo",Ụkwụ pụrụ ndị mmadụ ọsọ n'ebe a na-agba nkwụ nwaanyị n'Isiala Mbano dị n'Imo steeti ka egbe ndị uweojii na-agba iji mee amansị tụrụ mmadụ abụọ.,"Onyeisi ndị uweojii Naijirịa machiri ndị uweojii iso ndị nnukwu mmadụ na nsonso a Akụkọ kwuru na ndị uweojii abụọ so ndị nwere agba gaa agbamnkwụ otu nwata nwaanyị e nyere aha ya dịka, Chilụaka Agụaka, n'ụbọchị ụka, gbagburu mmadụ abụọ. Mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti bụ Andrew Enwerem, gwara BBC Igbo na n'ezie na ọ bụ naanị ahụ ka ndị uweojii merụrụ mmadụ abụọ ahụ, na ha anwụghị anwụ. Enwerem kwukwara na ọ bụ ndị uweojii si steeti ọzọ ndị na-enweghị ikike site n'aka Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Ezike, mere ihe ahụ. Enwerem sị: ""E nwere ndị uweojii du nnukwu mmadụ abụọ gaa ebe a na-agba nkwụ merụrụ mmadụ abụọ ahụ. Mmadụ abụọ ndị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua na-anara ọgwụ. Onweghị onye nwụrụ n'ihi ya. Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti enyela iwu ka e nyopụta ebe ndị uweojii ahụ siri bịa na ihe mere ha jiri gbaa ya bụ egbe."" Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu n'ime ndị uweojii na-eme ụghara n'ebe a na-agba nkwụ nwaanyị, ji otu aka na-agbali egbe AK-47, ma egbe ahụ pụnahụrụ ya gbanye n'etiti ndị mmadụ. Mgbọ merụrụ mmadụ abụọ e nyere aha ha dịka Ikechukwu Onwudiwe na Uzochukwu Ogbuhuruzo, ezigbote ahụ; otu n'aka, otu n'ụkwụ. Akụkọ kwuru sị na dịka e buuru ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ Imo State University Teaching Hospital, Orlu, ndị ntorobia ji iwe chọrọ ịkụgbu ndị uweojii ahụ mana ndị na-eme mmemme zọrọ ha. Mgbe onye ntakụkọ jụrụ Enwerem ma anwụchịrị ndị uweojii mere nke a, ọ kọwara na oge ndị uweojii rutere ebe ahụ, na ndị uweojii kpara mkpamkpa ahụ agbafuola. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56877872,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56877872,Igbariam Attack: Ndị amabeghi ndị ha bụ egbuola mmadụ itoolu - Ndị uweojii,Ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ na mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Igbariam gwara BBC na ndị a mabeghị ndi ha bụ wakporo ezinaụlọ bi nso n'ebe ụmụakwụkwọ bi were gbuo ọtụtụ mmadụ.,"Ụmụakwụkwọ a kwuru na ndị a e gburu bụ ndị ezinaụlọ na-achị ehi bi n'ulọ ahụ ruo otu afọ. Ndị uweojii si na ọ bụ n'obodo Ukpomachị nke Ọkụzụ di n'okpuru ọchịchị Oyi ka ihe mere. Ebe ahụ dị nso Igbariam Junction nke dị nso na Igbarịan bụ obodo mahadum Emeka Odumegwu Ojukwu dị. Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Anamabra bụ Tochukwu Ikeokwu gwara BBC Igbo na ha anụla maka mkpa mkpa kpara na mpaghara ahụ ahụ mana ha ka na-eche ka ha mata akụkọ niile dị n'ime ya. Otu onye bi nso n'ebe ahụ gwara BBC na nke a mere ka ụmụakwụkwọ Mahadum Odumegwu Ojukwu dị nso n'ebe ahụ buru ngwongwo ha gbapụ ọsọ maka egwu ihe nwerike ịme. O kwukwara na o nweghi nsogbu ọbụla ndị ahụ ọ sị bụ ndị Fulani na-achị ehi e gburu na ndị obodo ahụ na-enwe kemgbe otu afọ ha bi ebe ahụ. Ebupula ozu ndị ahụ ahụburu ebe ahụ dịka ndị agha na ndị uweojii bịara ebe ahụ ịchọpụta ihe mere n'ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị Monde. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ mahadum ahụ agbapụla n'obodo ahụ. Otu n'ime ha gwara BBC Igbo na ọ bụ ụjọ na e nwereike bịa megwara mere ha ji agba ọsọ. Nwata akwụkwọ ahụ sị na ọ bụ n'ime abalị ka ndị bi nso n'ulo ndị Fulani ahụ bi nụtara kepu kepu na a na-awakpo ha. Ọ sị: ""Anyị pụtara n'ụtụtụ hụ na egbuola ndị Fulani ahụ bere akụkụ ahụ ụfọdụ n'ime ha pụọ."" Ndị a e gburu gụnyere ụmụnwaanyị, ụmụaka, na ụmụ nwoke. Kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti bụ Don Adinuba gwara BBC na gọọmentị ha na-eme nnyocha ihe a mere iji mata ebe o si. Gọọmentị Anambara tinyere mmachị ngagharị n'Igbariam, Aguleri, Umueri, Nteje, Awkuzu na Umunya. Machị ngagharị nke ga-esite elekere asaa nke ehihe ruo elekere isii nke ụtụtụ maka ogbugbu mmadụ nakwa ụjọ dị n'obodo ahụ Ihe mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu kwuru Mahadum ahụ ekwuola na ohe a mere emeghị n'ime ụlọ akwụkwọ ha, nke mere ha jiri sị ka ụmụakwụkwọ laghachite akwụkwọ. Dịka ụlọ ntaakụkọ Anambra Broadcasting Service siri kwuo, ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ akwụkwọ ahụ bụ C.C. Chukwueloka binyere aka n'ozi a. Ozi kwuru na onweghi nwata akwụkwọ mahadum nwụrụ na nwakpo a dịka ọtụtụ mmadu na soshal midia na-ekwu. Ha sịkwa na etinyela nchekwa ọfụma na mahadum ahụ. Ihe ndị uweojii kwuru N'akwụkwọ mgbasaozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii binyere aka na ya, ndị uweojii n'Anambara sị na ọ bụ mmadụ 9 nwụrụ na mwakpo a. Ha si na amabeghi ndị bu ndị a e gburu, n'agbanyeghị na ndị bi ebe ahụ gwara BBC na ọ bụ ezinaụlọ ndị na-achị ehi ka ọdachị dakwasịrị." 50158356,https://www.bbc.com/igbo/50158356,Border Closure: 'Rice akọọla n'ahịa n'ihi mmechi border' - Ndị ahịa,Ọtụtụ ụlọahịa ebe a na-ere osikapa n'ahịa 'Mile One' nke dị na Pọtakọtụ emechiela kamgbe gọọmentị etiti mechiri okeala Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu iji kwụsi ịtụbata osikapa mba ofesi.,"Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa Onyeisi otu jikọrọ ndị na-ere osikapa n'ahịa ahụ bụ Anselm Nwachukwu gwara BBC na ihe kpatara nke a bụ maka na ha ahụghị osikapa zụta. Nwachukwu kwuru sị: ""Mmechi 'border' a metụtara ahịa anyị nke ukwuu."" ""Ọ dịghị m ka gọọmentị etiti echere ihe a ọfụma tupu ha emechie oke ala."" ""Ha kwesịrị ịgbalị hụ na nri dị n'uba tupu ha emechie ya."" Anslem Nwachukwu, onyeisi ndị na-ere osikapa n'ahịa 'Mile 1' Pọtakọtụ. N'otu aka ahụ, Emeka Okameme, onye na-atụ mgbere osikapa kwuru na ahịa ha na-agbada agbada ugbua. O kwuru sị: ""Osikapa adịghị, ma nke Naịjirịa, enweghị nke dị."" ""Mgbe ha mechiri 'border', anyị che na anyị ga-ahụ osikapa Naịjirịa, mana onweghị nke anyị hụrụ."" ""Ihe nke a gbara anyị gharịị nke ukwu."" Akpa osikapa ebuzihi ibu n'ụlọahịa ""N'oge mbụ, anyị na-azụ otu akpa osikapa mba ofesi puku naịra iri na isii maọbụ iri na asaa, ebe nke Naịjirịa bụ puku naịra iri na anọ."" ""Ugbua, osikapa Naịjirịa bụzi puku naịra iri abụọ na ise, mana ọnweghị onye na-ahụ ya."" Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka Njọ ahịa a rutụkwara ndị na-ere ihe nri ndị ọzọ n'ahịa ahụ. Okey Nnadi onye na-ere ọkụkọ kwuru na ọbụrụ na ndị mmadụ bịa ịzụrụ osikapa, ha na-azụkwa ihe ndị ọzọ, mana ugbua, njọ ahịa jizi ma onye ukwu ma onye nta. Nnadi rịọrọ gọọmentị ka ha leba okwu mmechi oke ala ahụ anya ka ahụhụ ghara igbu ndị mmadụ tupu mmemme ekeresimesi eruo. Ndị n'ọchị, ndị n'akwa Ọtụtụ ụlọahịa n'ahịa 'Mile 1' mechiri emechi. Mana ndị na-ere ọka kwuru na mmechi okeala Naịjirịa mere ka ọnụego akpa ọka gbalie. Akpa ọka a na-erebu puku naịra ise bụzị puku naịra itoolu ugbua. Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụugbo na-akọpụta ọka bụ Bello Abubakar Funtua kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari mere nke ọma. Ndị ọrụubi na-akọpụta ọka Funtua kwuru na ndị otu ha kọpụtara ọka karịrị nde 'tonne' iri abụọ (20m toones) n'afọ gara aga. O kwuru na ha nwere ọka n'uju maka ụlọọrụ ji ọka arụpụta ihe dị icheiche ka ha bịa zụrụ. N'okwu ya, ""Anyị nwere ngalaba ha na gọọmentị na-arụkọ ọrụ iji hụ na ego akpa ọka arịghị elu karịa ka ọ dị ugbua."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ" afirika-55212698,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55212698,Ghana Election 2020: Ndị pati mgbagha mba Gana ajụla mpụtara ntuliaka nyere Nana Akufo-Addo mmeri,Pati anọghị na gọọmentị mba Gana bụ ndị isi mgbagha ajụla mpụtara ndị ọrụ ntụlịaka ha nụ Ghana Electoral Commission wepụtara bụ nke nyere Nana Akufo-Addo mmeri.,"Ya bụ Pati ndị mgbagha bụ National Democratic Congress sị na-enwere ọtụtụ nrụrụaka na ya bụ ntuliaka mana ha ga-agwa ụwa ebum n'obi ha mgbe adịghị anya. Ndị ụlọọrụ ntuliaka mba ahụ bụ nyere Nana Akufo-Addo mmerị ka ha mechere ntuliaka onyeisiala mba ahụ. Ndị ọrụ nnyocha ya bụ ntuliaka mba Gana nakwa ndị mba ofesi sị na enweghị ihe nruruaka ha hụrụ na ya bụ ntuliaka. Akufo-Addo nke otu 'New Patriotic Party' (NPP) ji voootu dị pasent 51.59 nke bụ vootu dị ọnụọgụgụ 6,730,413 were merie. Ihe meburu Ngụkọ vootu a tụrụ na na ntuliaka mba ahụ ka na-aga n'ihu dịka a gụkọchabeghị vootu nile a tụrụ na ntụliaka ahụ mana onyeisi EC bụ Jean Mensa kwuru na nke a gụrụla ezuola ịma onye meriri. Mensa kọwara na mpụtara ọ kpọpụtara enweghi vootu mpaghara ndida Techiman n'ihi na ngụkọ ka na-aga ihu ebe ahụ. E mechaala ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana dịka ndị ọrụ ntuliaka si kwuo Ihe fọrọ ugbua bụ ka a gụkọọ mpụtara ntuliaka ndị a na mpaghara iri na isii ebe e mere mbinyeaka n'akwụkwọ ma kpọpụta onye meriri. Ndị uweojii Gana nwuchiri ndị ọrụ ntuliaka abụọ aka ha dị na nrụrụaka n'Awutu Senya West na Bawka Central. Onyeisi ndị uweojii Gana sị na a gbara mmadụ abụọ egbe na mpaghara Awutu Senya East. Onyeisiala ha bụ Nana-Akufo-Addo arịọla ka udo chịa na mpaghara niile. Ọ bụ n'ime otu ụbọchị ka a ga-ama onye meriri. Etu ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana si gaa Akụkọ a chịkọtara ka ntuliaka nke ọkwa onyeisiala mba Ghana si aga ugbua. Onyeisiala mba , Nana Akufo Addo atụọla vootu ya na woodu Rock Ages preparatory school 1and 2 Kibi. Ọ sị na obi dị ya ụtọ etu ntuliaka ahụ si aga nke ọma na mba ahụ. John Dramani Mahama atụọla vootu ya John Mahama bụ onye ji ọkọlọtọ pati NDC nakwa aka chiburu Ghana atụọla vootu ya. O kwuru na oge ka pere mpe ikwu ka ya bụ ntuliaka si aga mana o ji nkeji atọ tụọ vootu ka ọ tụchara vootu na Bole. Foto dị n'elu gosiri etu onye ụlọọrụ ntuliaka Ghana si wetu igbe ntuliaka ka onye olusi tụọ vootu Ọ bụghị eziokwu na-afojuru igbe ntuliaka n'ọdịda anyanwụ Ghana Ndị uweojii nọ na Ghana ekwuola na amabeghị ma ebubo na-afọjuru igbe ntuliaka na ndịda anyanwu Ghana abụ eziokwu. Ha kwuru ka ndị Ghana dere jụụ makana ha na-enyocha ma ebubo a abụ eziokwu ma gwa ha nchọpụta ha. Ọnụọgụgụ ndị ga-atụ vootu na ntuliaka a Ntuliaka a ga-eji họpụta onye ga-abụ onyeisiala mba Gana malitere n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2020. Ihe ruru mmadụ iri na otu gụnyere onye bụ onyeisiala aha ya bụ Nana Akufo-Addo so azọ ọkwa mba ahụ. Onye ọrụ BBC nọ n'ebe ahụ kọwara na ndị mmadụ pụtara n'ọgbọ ntụliaka kamgbe elekere abụọ nke etiti abalị ịkwụnye n'ahịrị maka ntuliaka ahụ. Ndị mmadụ pụtara n'oge ịbịa tụ vootu A ga-eme ntuliaka a n'ọgbọ ntuliaka ruru puku iri atọ na asatọ n'ogbe iri na isii dị na Ghana. Onyeisioche Ghana Electoral Commission kwuru na ọ bụ nanị ngalaba ha nwere ikike ịkpọpụta vootu dịka iwu si kwu. Onyeisiala mba Ghana ugbua bụ Nana Akufo-Addo kwuru na ndị Ghana ekwekwala ka Covid-19 nabichie ha ipụta tụ vootu makana ndị ọrụ nchekwa ga-ememina ndị osochi egbu. Obere ọgbaghara dapụtara na ""City Engineer' polling station dị n'obodo Odododioodoo dị na Ghana Obere ọgbaghara dapụtara na 'City Engineers polling station, Odododioodoo Constituency' ka ndị na-atụ vootu malitere ịba mba maka etu ụfọdụ si akagbu vootu ha. Mana ndị ọrụ nchekwa pụtarakwara ozigbo belata ya bụ ọgbaghara. Ndị ụlọọrụ European Union nọkwa na-enyo ka ya bụ ntuliaka si aga n'ogbe Odododioodoo European Union Observer Union na-enyo ka ntuliaka si aga na mba n'ogbe Ofododioodoo. Ha gwara ndị ntaakụkọ okwu dịka ha na-ele etu ihe si aga." afirika-47824828,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47824828,David Malpass ga-anọchị anya Jim Yong Kim n'ụlọakụ mba ụwa niile,"N'ozi ụlọakụ ụwaniile bụ World Bank na Bekee zipụrụ site n'akara Twitter ha, ha kwuru na Malpass ga-ebido ọrụ n'ụbọchị Tuusde.","Ha kwuru na mmadụ niile jịkoro aka họpụta ya dịka onye ndụ ụlọakụ ahụ. End of Twitter post, 1 Ọ pụtara na David Malpass bụ onye mba Amerịka ga-anọchi anya Jim Yong Kim dịka ọ rituru n'ọkwa n'ọnwa Febụwarị. Ụmụakwụkwọ LUTH ebee arịrị Stephen gụrụchara akwụkwọ na Mahadum Legọs na ngalaba Dọkịnta n'afọ 2018. Ndị uweojii na Legọs ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụo bụ ndị aka ha dị n'ọnwụ Stephen Urueye. Ndị uweojii kwukwara na ha amalitela nyocha banyere ọnwụ nwoke ahụ. Cheta na ọ bụ n'abalị ụnyaahụ ka ndị ohi zuru Stephen ohi ma sụọ ya mma n'ihu ụlọakwụkwọ LUTH dị na Legọs. Ha kwukwara na ọ bịara otu ụbọchị dịka o mechara mmemme ngụcha Mahadum. Ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharịiwe maka na ha na-ekwu na ọ bụghị taa ka ndị omekome bidoro ịmaja na ịwakpo ha. Nigeria na-arụ ọdọụgbọmmiri ọhụrụ Dịka Hadiza Usman, onyeisi ngalaba n'ahụ maka ọdọụgbọmiri sị gwa ụlọakụkọ Bloomberg, Naijirịa na-arụ ọdọụgbọmmiri miri emi nakwa ọdọ ngwaahịa abụọ iji belata kpachikpachị dị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa Legọs. Otu na Lekki Free Trade Zone dị na Legọs. Nke ọzọ na Badagry dịkwa na Legọs, ebe nke atọ bụ ọdọụgbọmmiri Ibom dị na Akwa-Ibom. Ụgwọ Naijiria ji akarịala nke afọ gara aga Ụgwọ Naijiria gbazitere arịala elu site na tarịị Naira iri abụọ na otu na ụma(N21.73trn)ọ bụ n'afọ 2018 gbaruo tarịị iri abụọ na anọ na ụma(N24.39trn) dịka ngalaba na-ahụ maka ijikwa ụgwọ nke a kpọrọ debt Management office siri kwupụta ụbọchị Tọsde n'Abuja. O jiri pasent 12.25 gafe nke afọ 2018. APC na-agbagha mpụtara ntuliaka Adamawa,Bauchi na Sokoto Otu APC ekwuola na mmeju ntuliaka Inec mere na Bauchi, Sokoto nakwa Adamawa adanyeghị na anya ya dịka ha boro ebubo wuruwuru, tigbuo-zogbu na igo vote, ma kwuo na ha ga-aga ụlọikpe ịdọgha mpụtara ntuliaka ndị ahụ. Ha kwukwara na ebubo na onye nke ha bụ onye meriri na ntuliaka Gọvanọ na Kwara steeti Abdulrahman Abdulrazaq ji asambodo secondịrị adigboroja bụ akụkọ Mike ejeagha nke ndị e meriri emeri na-akọ. Ndị uweojii achụọla onye otu ha maka ọnwụ Kayode Johnson Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu na nna Kayode Johnson oge ọ gara leta ezinaụlọ ahụ ndị uweojii gburu nwa ha bụ Kayode Johnson Ndị uweojii Legọs atuọla alo ha achụọ Inspector Olalekan Ogunyemi n'ọrụ uweojii ka e kpechara ya ikpe imeụlọ maka ogbugbu otu nwata nwooke a kpọrọ Kolade Johnson bụ onye a gbagburu ebe ọ na-ekiri oolu na Mangoro na Legos. Mana a hapụrụ ogbo ya bụ Sergeant Godwin Orji sị ya lawa na ikpe amaghị ya. Na egwuregwu, Obi adịghị Danny Rose mma maka ịkpa oke akpụrụ Danny Rose bidoro ịgbara England bọọlụ n'afọ 2016 Danny Rose nke Tottenham kwuru na ike egwu bọọlụ agwụwala ya dịka ikpa oke agbụrụ na-ari ibe ya elu na bọọlụ. Rose, onye so ndị egwu ball England akwara emo na asompi e ji akwado Euro 2020 nke a gbara na Montenegro tụrụ arịrị na o nweghị ezi ahụhụ a na-enye ndị kpara oke agbụrụ na bọọlụ. Akụkọ niile dị mkpa taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-53417878,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53417878,"Ihe pụtara na nzụkọ udo ndị Ipob, Ohaneze na Ohaneze General Assembly",Ohaneze na ndị otu Indeginous People Of Biafra (Ipob) akọwala ka ha siri kpee udo dịka Mbazulike Amechi kpọrọ otu abụọ a nzụkọ na bee ya.,"Ipob na Ohanaeze Ndigbo Ọ bụ maka iwu Nnamdi Kanu nyere ka ndị Ipob ọbụla hụrụ Mazị Nnia Nwodo tụọ ya okwute. Otu abụọ a kwetere na ha zutere ma kpee udo kama ọtụ ọzọ kpọrọ onwe ha Ohaneze General Assembly ekwuola na ọ bụghị ohaneze biara nzụkọ a. Nnia Nwodo bụ onyeisi ohaneze ndị Igbo gwara ndị BBC Igbo na ọ bụghị okwu ohaneze ọbụla ka o na-etinye ọnụ ya mere ọgaghị ekwu ihe ọbụla gbasara okwu mkpezi a. Onye okaiwu ndị otu Ipob na nke Nnamdị Kanụ bụ Aloy Ejimako kọwara na mgbe ha gara ya bụ nzụkọ, na ọ bụ Damian Okeke-Ogene dụ ndị Ohaneze bia. O kwukwara na ọ bụ Nnia Nwodo zitere ha ka ha nọchite anya Ohaneze na ya bụ nzụkọ. Aloy kwuru na isi ya bụ nzụko bụ maka okwu mazị Kanu kwuru ebe ọ nyere iwu ka ndị otu Ipob tụọ Nwodo okwute ebe ọbụla ha hụrụ ya. O kwukwara na Kanu ekwugharịala ihe o kwuru ma sị ka onye ọbụla hara ịtụ Nnia Nwodo okwute. Kama ndị Ipob gwara ndị Ohaneze ka ha gwa ndị gọvanọ steetị ọwụwa anyanwụ ka ha gbaa mbọ wepụ mmachi amachiri ndị Ipob dịka ndị otu oyi egwu. Ha kọwara na-enweghị etu ndị Ohaneze na ndị a kpọrọ ndị oyiegwu ga-esi enwe mmekọ ziri ezi. N'otu aka ahụ ka Okeke-Ogene na-ekwu na ha e kpeziela ma sịkwa na ọrụ onyeisi ha bụ Nwodo bụ ihụ na ndị Igbo ketere oke nke ha, na ọrụ ya abụghị ikewapụ ala Igbo na Naijirịa. Ndị Igbo ji ekwurekwu ebutere onwe ha nsogbu na Naịjirịa - Onyeisi Ohaneze Legọs Mana mazị Emejulu Okpalukwu Okpaleze bụ onye ọnụ na-eru n'okwu nke otu kpọrọ onwe ha ""Ohaneze General Assembly"" kwuru na ọ bụghị Ohaneze biara ya bụ nzụkọ. Ọ kọwara na ndị biara ya bụ nzụko ma onye zitere ha bụ ndị na-achọ itisa Ohaneze ma jiri kwa Ohaneze azota elele ndọrọndọro ọchịchi nanị ha ga-erite. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46730751,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46730751,Serena Williams: Federer egosila ya na mmadụ ka ibe ya,Ọpịa bọọlụ a ma dịka ọkaibe na tenis ụmụnwoke na mbaụwa bụ Roger Federer egosila Serena Williams na mmadụ na-aka ibe ya n' asọmpị ha gbara taa bụ Tuzde.,"Federer na onye otu ya bụ Belinda Bencic jiri ọkpụ 4-2, 4-3 merie Serena Williams na onye otu ya bụ Frances Tiafoe ka ha zutere n' asọmpi 'Hopman Cup' n'ụbọchị Tuzde na Perth. Asọmpi 'Hopman Cup' bụ asompi nke mba na mba na-asọrịta nke na-abụ n'etiti nwoke na nwaanyị iji kwado asọmpi 'Australia Open'. Nke a bụ mbụ Federer na Williams na-asọrịta mpi n'ụwa ha dịka ndị ọpịa bọọlụ. Williams na onye otu ya bụ nwoke nọchitere mba Amerika, ebe Federer na onye otu ya bụ nwaanyị nọchitere Swizaland. Tupu a gbaa asọmpi ahụ, Federer na Williams kwuru okwu gosiri na ha abụọ na-atụ onwe ha na anya. Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka mmadụ abụọ: Serena Williams Roger Federer N'akụkọ ọzọ, Dịka a batara afọ 2019, nwa mbụ a mụrụ n'alaigbo bụ Kamsi Eselu, bụ onye a mụrụ ka o ji naanị nkeji iri abụọ na anọ gafee elekere iri na abụọ (12:24 am) nke ụtụtụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị, na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Teaching Hospital dị n'Awka, Anambra steeti. Nwunye gọvanọ Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano, kwuru na Kamsi bụ ezigbo onyinye nye ndị Anambara Gụọ maka ụmụaka ndị ọzọ a mụrụ n'afọ ọhụrụ n'ala Igbo ebe a: First baby: Nwa mbụ a mụrụ n'Alaigbo na 2019 Ndị alakụba gara ụka Kraịst Ndị otu Islamic Movement of Nigeria bụ ndị otu Ibrahim El-Zakzaky e ji eji, so ndị ụka Katọlik gbakọọ n'ụka afọ ọhụrụ na St Mary's Catholic Church dị na Samaru, Zaria na Kaduna steeti. Onye du ha gaa ije ahụ bụ Ọkamụta Isa Mshelgaru nke Mahadum ABU, kwuru na ọ bụ iji mee ka mmekọrịta dị n'etiti ofufe abụọ ahụ siwanye ike. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Nọt Koria bụ Kim Jong-Un adọọla aka na ntị na o nwere ike igbanwe ebumnobi ya banyere ịkwụsị nrụpụta ngwaahịa nuklia ma ọ bụrụ na mba Amerịka gaa n'ihu imachibido ha. Gee akụkọ BBC na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Lee etu ndị Igbo si chụọ afọ 2018 New year eve: Lee ka ụfọdụ ndị Igbo si efere 2018 aka ụla" media-43722290,https://www.bbc.com/igbo/media-43722290,Mwakpo ndị ọchịehi:Ọ bụ okwute ka ga-akwụsị ha?,Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu nchekwa ala anyị bụsị onye-zọba-isi onwe ya.,"Ọ bụ ịma okwute ka ndị bi na Benue ga eji zọọ onwe ha? Okwu so akụkọ si na ụlọọrụ Punch kwuru na Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue steeti ekwuru ka ndị gbara ọsọ ndụ na Benue bidoro iji okwute na-azọ ndụ ha n'aka ndị ọchịehi ji egbe n'ihi na ndị agha adịghị njikere ịzọ ha. Ha dere na Ortom kwuru na ha kwesiri ịnwe njikere dịka David siri buso Goliati ọgwụ dịka akwụkwọ nsọ sịrị kwuo. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchiri ndị uweojii na Benue steeti bụ Joel Yamu n'elu ekwe ntị maka echiche ha gbasara udi okwu a. Mana o kwuru na-anubeghị ụdị okwu a n'ọnụ Ortom. Mana ọtụtụ mmadụ n'oge garaaga ekwuola na sọọsọ omume a ga-akwụsị ndị ọchịehi jiri egbe na-egbu ndị mmadụ. 'Okwu a enweghị isi' Samuel Ortom na ndị uweojii enweela nghọtaghe n'oge garaaga Michael Gotep biri na mpaghara ebe a nsogbu a dị gwara BBC Igbo na okwu a Ortom kwuru gosiri na nnukwu nsogbu di n'ala Naịjirịa. N'okwu ọnụ ya ""kee ka ndị mmadụ nkịtị ga-enwe ike ji sọọsọ okwute buso ndị jiri egbe ọgwụ?"". Gotep ju kwa ajụjụ na gini mmere ndị agha enweghị ike ịkwụsị ndị a jiri egbe egbu mmadụ. Gotep juru ""gịnị mere ego awapụtara maka ịbuso ndị a jịrị egbe agha?"" Jenkins Eni bubu onye biri n'Asaba na Delta steeti bubu ebe ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe na-ebuso ndị mmadụ ọgwụ kwuru na Naịjirịa enweghị ndị ọchịchị. Onweela ndị kwuru na ndị a na-egbu mmadụ abụghị ndị ezigbo ọchịehi Mana o kwetekwara na ihe Ortom kwuru. Eni kwuru n'uche ya, ụzọ ka mma ịgbanahụ nwakpo a bụ ị dị njikere ịchekwa onweha. N'onụ okwu ya ""ihe dị njọ n'ihe a bụ onwere ike ikesa ala Uwe ojii steeti Nrụrịtaụka a ebiliteela okwu gbasara uweojii steeti na nkpa o nwere na nchekwa obodo. Uweojii steeti ọ ga-ebute udo Naịjiria na-achọ Onweela ndị kwuru na sọọsọ uwe ojii steeti ga-akwụsị kpam kpam nkpankpa niile na-eme na steeti dị icheiche na Naịjirịa. Gotep na Eni gwara BBC Igbo echiche ha gbasara nrụrịtaụka a. Gotep kwuru na uweojii steeti ga-ebute mgbagwoju-anya maka ọrụ ha na nke ndị steeti ga-eyiri ibe ha. Ihe a ga-ebute esemookwu 'jurisdiction' dịka ndị bekee sịrị akpọ ya. Mana Eni kwuru na ya enweghị ntụkwasị obi na ihe akporọ uweojii steeti maka n'uche ya, ihe a ga-enye ndị uweojii ohere ịhọgbụ ndị mmadụ." afirika-50514448,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514448,Violence Against Women: Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinaụlọ na-emekpa gị,Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ụzọ ole na ole ha si a nabata mmegbu dị n'ezinụlọ nakwa mwakpo n'udiri ọbụla.,"Nke a mere ka otu United Nations wepụta ụbọchị Nọvemba iri abụọ na ise n'afọ ọbụla ịkusi okwu ike maka nkwụsị atụmaatụ ọjọ a. Lee ihe ịse ị ga-emenwu iji gbanarị udiri nwakpo ọbụla Titilola Vivour Adeniyi bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onyeisi ngalaba 'Lagos State Domestic Violence Response Team' na-ahụ maka iza oku ndị awakporo awakpo na Legọsị kwuputere ihe ndị a dịka: Kiki Mordi na-enye ụmụnwaanyị ndụmọdụ 1. Kwupute okwu Vivour rịọrọ ka ụmụnwaanyị ghara ịtụ ụjọ ikwupute maka etu esi wakpo ha maọbụ awakpo ha. O kwuru na nkwupute ga-enyere gị aka ka inweta enyemaka zuruoke ga-eme ka aka kpara onye na-awakpo gị. 2. Nwee ihe ngosi ị ga-eji chere onye ahụ n'ụlọikpe Vivour kwuru na ihe ngosi a ga-apụta site n'iga mee ahụ gị nyocha n'aka dọkịta, ihe ọ bụla o dere maọbụ nyochapụtara bụ ihe ị ga-eji chere onye wakporo gị n'ụlọikpe. 3. Wepụ okwu ahụ n'ụlọikpe O kwuru na enwela iwu megidere onye ọbụla wakporo nwaanyị na Legọs steeti. O kwukwara na nwakpo bụ agwa megidere steeti ya mere ntaramahụhụ so ya bụ ịga mkpọrọ ebiebi. 4. Bido na nwa kuziwere ụmụ gị maka ihe ọjọọ dị na ịmegbu mmadụ Ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ site n'obere kuziwere ụmụ ha bụ nwoke maka etu esi akwanyere ụmụnwaanyị ugwu. Vivour kwukwara na ọ ga-adị mma ka ụmụnwoke bido na nwata hụtawa ụmụnwaanyị dịka mmadụ ibe ha. 5. Obodo kwesiri ị guzo kwado ụmụnwaanyị ka ha kwuputa maka mwakpo Vivour chọrọ ka obodo kwado nwaanyị ọbụla beputere akwa na a na-awakpo ya ebe ọbụla. Ha mata na o nwereike ịbụ onye nke ha echi. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49189402,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49189402,Catholic Priest Killing: Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu,"Onyeisi ndị Uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka achọpụta ndị gburu Fada Paul Offu, bụ onyeisi ụkọchukwu St. James the Greater Parish Catholic Church, Ugbawka, Enugu steeti.","Mohamed Adamu enyela iwu ka achọta ndị gburu ụkọchukwu Ndị fada niile n'Enugwu Diocese mere ngagharịiwe ubọchị Fraide maka ogbugbu e gburu Fada Paul Offu nakwa ndị fada ndị ọzọ amabeghị ndị gburu. A gbagburu Fada Offu na mgbede Tọzde oge ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke ya, dịka a gwara BBC Igbo. Ndị ụkọchukwu Enugwu Diocese mere ngagharịiwe Ndị ụkọchukwụ na-eme ngagharịiwe n'Enugwu steeti sị na ha achoghi ndi ọchiehi na-egbu mmadu. Ndị amabeghị ndị ha bụ gbagburu Fada Paul Offu ụbọchị Tọzde ka ọ na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke n'Ihe, Enugwu steeti. Mkpamkpa a mere ka ndị ụkọchụkwụ n'Enugwu 'Diocese' mee ngagharịiwe maka na enweghị ezi nchekwa n'Enugwu Steeti. Lee ihe nkịrị a maka ngagharịiwe ndị ụkọchụkwụ a mere : Ndị ntọ a tọrọla ndị ụkọchụkwụ ise nke ""Redeem Church"" Ndị ụkọchụkwụ 5 nke 'Redeem Christian Church of God' abụrụla ndị nọ n'aka ndị ntọrị. Ndị ntọ atọrọla ndị ụkọchukwu ụka 'Redeemed Christian Church of God' n'okporoụzọ Ijebu-Ode n'ụtụtụ Fraide. Ndị ụkọchukwu ahụ na-aga ọgbakọ kwa afọ nke ndị ụka 'Redeemed' na-enwe n'ọnwa Ọgọstụ afọ ọbụla n'ogige ha a kpọrọ 'Redemption Camp' dị na Mowe, Ogun steeti. N'Ofesi Achụọla Pastor Timothy Omotosho ọso ukwu eruala n'Saut Afrịka Onye ndu 'Jesus Dominion International church' ama ama na Suat Afrịka bụ Timothy Omotoso abụrụla onye ndị mba Saut Afrịka gbaara ugbọ nwankpi . Ha sị na ha achoghizi ihu ukwu ya na mba ahụ maka ebubo iwakpo nwanyị. Ihe i kwesiri ịma maka nwafọ Naịjirịa Boris Johnson họpụtara 'Anyị agaghị akwụsị ngagharịiwe tutu a kwụsị igbu ụmụ Naijiria na Saut Afrịka' N'egwuregwu Harry Macquire gbara afọ 26 ga-ebido nyocha ahụ otu bọọlụ Manchester United Ndị otu bọọlụ Manchester United ejirila ego ọkpụrụkpụ 'pound' nde iri asatọ were zuta Harry Macguire nke Leicester City. Ka o si dị ugbua, Harry abụrụla onye nchekwa bọọlụ kacha daa ọnụ n'uwa niile. Ndị agha Naịjiria agọrọla ọnụ ha n'akụkọ pụtara na ha na-atụbanye ma lie ndị otu ha Boko Haram gburu n'ili a na-arụbaghị ama. Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Onyema Nwachukwu kwuru sị na ndị ntaakụkọ ebe akụkọ a si pụta amaghị usoro dị n'ịkwa ozu onye agha Naịjirịa. N'akwụkwọ ozi o kesara, o kwuru na usoro olili ndị agha gụnyere mbugharị, ikpe ekpere, ịgbapụrụ ha egbe nakwa ihe ndị ọzọ. O kwuru n'ebe a na-eli ozu ndị ntaakụkọ boro ha ebubo maka ịtụnye ndị otu ha, bụkwanụ nke dị n'ebe a kpọrọ Maimalari Military Cantonment, ebe ndị agha na-eli ndị otu ha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke ugwu Naịjirịa. Cheta na ndị Wall Street Journal boro ha ebubo sị na otu onye agha Naịjirịa gwara ha na a ""na-eli ndị otu anyị n'ili a na-arụbaghị ama n'ime abalị... ebe a ga-anọ echefu maka ha"". Ndị Agha Naịjirịa sị onye ọbụla kpọọ okwu ahụ n'imi, na ọ bụghị eziokwu. Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ Akụkọ ọzọ yiri ya: Ihe ruru ndị agha iri abụọ na ise na ndị Islamic State iri anọ anwụọla na Borno steeti. Ndị ma maka ọgụ a tara isi ha sị na o mere mgbe ndị otu Islamic State wakporo ogige ndị agha n'obodo Baga n'ụbọchị Monde. Ka anyị tụọ ụkwụ n'ofesi, Ụmụnwaanyị nwetara ikike ịnya ụgbọala n'ọnwa Juun 2018 Ụmụnwaanyị Saudi Arebia ga-amalitezi ime njem si na mba fere na mba na-echeghi ka nwoke sị ha eh maọbụ mba. Ọkwa ọhụrụ a enyekwuola ha ikike iji aka ha tinye akwụkwọ maka nwa ọhụrụ a mụrụ, alụmdinanwunye nakwa ịgba alụkwaghịm. Lee ụzọ ise ụmụnwaanyị Igbo si dị iche na ndị nke ụmụnwaanyị mba Saudi . N'egwuregwu, Pepe so otu egwuregwu Lille dị na mba Frans gafeta Arsenal Nicolas Pepe nke mba Aịvọrị Kost abụrụla onye kacha akpata ego site n'ịgba bọọlụ nke mpaghara Afrịka dịka Arsenal kwụrụ nde paụnd iri asaa na abụọ iji zụta ya. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị: 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk" afirika-51354016,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354016,Okada Ban: Etu anyị si taa ahụhụ ịga ọrụ taa - Ndị Legọs,Ụbọchị Monde izu ọbụla bụ ụbọchị ndị ọrụ Bekee na ndị ọrụ dị icheiche ji alaghachi ka e zuchara ike ngwụcha izu.,"Keke Ban: A napụla anyị na ụmụ anyị nri n'ọnụ Mana ndị bi na Legọs takutere ya kọnkịrị dịka ọtụtụ n'ime ha tọrọ n'ụzọ maka mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na okada. Ihe ọzọ pụtara na mmachi a bụ njakịrị ndị mmadụ ji ya ama onwe ha n'elu soshal midia, ọ kachasị ndị ebighi na Legọs. ""Dear Lagosians"" ""Lagos"" ""Otrek"" ""Okada ban"" bụ ihe ndị na-ewu na soshal midia n'ihi ya. Tife gwara ndị mmadụ ka ha hie asaa n'anya maka ndị ntọ ga-achọ ime ka ha a na-enyere ha aka. Joe Abah na-ekwu na gọọmentị echeghị atụmatụ a eche ọfụma tupu ha amalite ya. Dr Pampam kwuru na ọ bụ ụgbọala ""Danfo"" na-ebute kpachi kpachi n'ụzọ mana ọ bụ keke na ọkada ka ha machiri. Ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe maka ya bụ okwu, ebe ndị ọzọ na-aluso ndị uweojii ọgụ n'ihi mmachi a. KingMide kọwara ihe anya ya hụrụ mgbe ọgbaghara dapụtara. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi" egwuregwu-43190136,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43190136,Lai Mohammed: Ọ bụ Ụmụakwụkwọ 110 na-efu n'obodo Dapchi,"Lai Mohammed ekwuola na ọ bụ ụmụagbọghọ 110 na-efu n'ụlọakwụkwọ Government Science and Technical College dị na Dapchi, Yobe State.","Ka otu izu na-achọ ịgafe ka ndị Boko Haram wakporo obodo Dapchi dị na Yobe steeti, gọọmentị Naịjirịa ekwuputala na ọ bụ ụmụakwụkwọ 110 ka a tọrọla n'ụbọchị Mọnde ahụ. Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed, depụtara akwụkwọ nkwuputa ebe ọ kpọpụtara ọnụọgụgụ mmadụ ole na-efu ka ọ gara Yobe steeti ọzọ taa. O kwuru: ""Anyị nọ na Yobe steeti ebe anyị na-agba mbọ imeda obi nne na nna ụmụagbọghọ ndị ahụ, ime ka ha mara na ọbụghị nanị ha kwụ, imekwa ka ha mara na anyị agaghị ezu ike ruo mgbe achọtara ụmụaka ahụ. Anyị ga na-ebu nne na nna ndị a n'ihe niile anyị na-eme gbasara ya."" Mohammed kwuputara nke a na nzukọ ya na ndị gọọmentị etiti, gọọmentị Yobe, ụlọakwụkwọ ahụ, ndị nne na nna, ndị nchekwa na ndị gọọmentị ọchịchị obodo Bursari ebe Dapchi dị, nwere na Damaturu taa. O kwuru n'onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Adama Abdulkarim na Mohammed Lamin bụ kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Yobe gwara ya na ụmụakwụkwọ 906 nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ ụbọchị awakporo ha Nke a na-abịa ka nne na nna ụmụagbọghọ a depụtara aha mmadụ 105 na-efu." afirika-44672488,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44672488,Saraki: Chụọnụ ndị isi ọrụ nchekwa,Saraki kwuru na ọ bụrụ na-achụọ ndị isi ọrụ nchekwa nọ ụgbua na ọ ge-enye ohere ị webata ndị ga-arụnwụ ọrụ nchekwa ọfụma.,"Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti O kwuru nke a mgbe ọ gara ị leta ndị idere mmiri na-enye nsogbu n'Ilorin n'ụbọchị Satọde. Sarakị yọro ka aghara iji ihe gbasara ọrụ nchekwa Naịjiria mere ihe ndọrọndọrọ ọchịchị. N'oge na-adịghi anya otu akpọrọ ''Amnesty international'' kwuru na-egbuola ihe ruru mmadụ 1,813 site n'ọnwa Jenụwarị ruo ugbua. Ogbugbu a metutara steeti 17 ma ọnụọgugụ ya na-abawanye nke ịkarị ọgbugbu mere na afọ 2017. Otu a bokwara ya bu ihe mberede n'isi ndị ọchịchị Naịjirịa makana enweghị ike ị kwusi ogbugbu ndị a. Saraki boro ndị ọru nchekwa ebubo adịghị n'otu. O kwuru na ndị otu ulo omeiwu ọ na-achị nyere ndụmọdụ etu a ga-si gbochie ya bụ ọdachị mana ndị isi ọchịchị gbara ha nkiti maka ihe ọ kpọrọ aka ndọrọndọrọ ọchịchị eji eso ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43866791,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43866791,Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta,"Akpụ bụ nrị a na-erikarị na mpaghara Afirika, Asia na Saụtụ Amerika makana ọ dị ebe niile dị kwa ọnụala na ebe ndị a.","Ọtụtụ mmadụ na mba Afrika na-eri akpụ Akpụ na-enye ahụ ikikere na-emekwa ka ahụ kpuo ọkụ etu o kwesiriekwesi. E nwereike ị bacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri. E nwere akpụ na-atọ ụtọ ma nwee kwa nke na-elu inu. Akpụ a na-akwado iyọ Akpụ tọrọ ụtọ nwere Kemikal sinaid na-erughị 50mg n'otu kilogram mana akpụ na-elu ilu nwere sinaid ruru 400mg n'otu kilogram. Lee nri ụzọ ole na ọle eji akpụ emepụta: A na-eji akpụ eme Abacha: Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị Akpụ asụrụ asụ: Akpụ asụrụ asụ A na-eji ya emeputa achịcha Achịcha bụ ihe ọtita ndị Naịjirịa na-eri karị Akpụ mmiri Akpụ mmiri so na otu ihe ọtụta eji akpụ eme. A na-eji akpụ emeputa Gari Ụfọdụ ndị Naịjịria ejighị Gari ọṅụṅụ egwu egwu Supageti Akpụ bụ nnukwu nri na Afirika Eji akpụ ese nrị A na-eji karị ofe ọgbọnọ eri nrị osise A na-akwọ akpụ were ya mee ọtụtụ ihe Akpụ akwọrọ akwọ Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ: Nri eji akpụ emepụta karịrị akarị. BBC Igbo ga-achọ ka ị setere ihe onyonyo nri ndị eji akpụ eme na obodo ụnụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52378355,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52378355,Nnamdi Kanu: Akụkọ ụgha na ọ nwụọla echetarala ndị mmadụ ihe ọ na-ekwu maka Buhari,Soshal Midia Naịjirịa na-akpọtụ akpọtụ kemgbe abalị Tuzde dịka otu nwaanyị na-asị na ya bụ onye ntaakụkọ ama ama bụ Kemi Olunloyo kwuru n'ụdị o si ekwu maka ndụ Nnamdị Kanu.,"Buhari apụtala kwuo n'izuụka gara aga na ya abụghị Jubril nke Sudan Olunloyo dere n'akara Twitter ya na ya agaghị ekwunwu ma onyeisi ndị otu na-achọ ikewa Naijrịa ma nwete mba Bịafra akpọrọ ""Indigenous Peoples of Biafra"" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọ dị ndụ. Ọ gara n'ihu tụọ aka na onwereike coronavirus ataala isi Maazị Kanu, nke mere ka ndị otu ya kpọta onye ọzọ ga-anọchịte anya ya. Olunloyo dere si ""echi, a ga m agwa ụnụ ma onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ma ọ nwụọla ka e nwere onye si mba Sudan na-anọchite ya dika ọ nwụrụla"" O dere nke a dika o wepụrụ nke mbụ o dere dika ndị na-akwado Nnamdi Kanu jị ịbụ ọnụ sosie ya n'ike. Okwu a na-echetara ndị mmadu okwu Kanu na ndị otu ya na-ekwukarị maka onyeisiala Naijịria bụ Muhammadu Buhari. N'agbanyeghị na ihe niile ọ na-ekwu maka ọnwụ Buhari enweghi isi nke o ji enwe ọdụ, Kanu na ndị otu ya na-ekwusi ya ike sị na onyeisiala Naịjirịa anwụọla ma sịkwa na ọ bu otu nwoke aha ya bụ Jubril si mba Sudan na-anochite anya ya ugbu a. BBC Igbo nyochara okwu a Kanu na ndị otu ya na-ekwu maka Buhari, ma kpọọ ya ihe ọ bụ - okpotokpo asị. Gụọ maka nyocha anyị mere ebe a: Ugboro ise akụkọ ụgha kpọtụrụ n'Ala Igbo. Ọ na-ada na ntị ka Olunloyo ọ chọrọ ịgbanyetu Kanu ọgwụ ya ka ọ hụta etu o si atọ. Nke a mere ka ụfọdu ndị mmadu na-asị na Nnamdi Kanu ga-eme ihe onyonyo were gosi ndị ụwa na ọ ka dị ndụ. Ma gosikwa ihe igba ama ndị mmadụ ga-eji mara na ọ bụ ya n'ezie. N'aka nke ọzọ ka ụfodụ ndị mmadụ na-ewesị Olunloyo iwe maka ihe o kwuru. N'isi ụtụtụ ụbọchị wenezde ka Olunloyo tụgharịrị were depụta n'akara twitter ya na Nnamdi Kanu ka dị ndụ. Ọ sị: ""Nyocha m mere n'abalị gosiri na Nnamdi Kanu ka dị ndu, o nweghi mgbe o jiri gaa mba Italị maọbụ nọrọ n'ụlọọgwụ. Mụ na nwanne m bụ Femi Fani-Kayode akpaala o were gwa m na kanu anwubeghị na ha abụọ akparitala ụka."" BBC Igbo kpọtụrụ otu onye ya na Nnamdi Kanu na-adị na mma ịmata ebumnuche ya maka okwu a mana ọ sị na ọ bụ na mgbede ka onyeisi Ipob ga-ekwu okwu banyere ya. N'agbanyeghi nke a, nchọpụta BBC bụ na Maazị Kanu ka nọ n'ala mmadụ, dịka ọ ka kwuchara okwu n'ụbọchị Satọde gara aga. Ọzọ bụkwa na ya bụ nwaanyị na-ekwu okwu bụ onye na-agbakarị egbe ọnụ na Twitter site n'ịsị nke a na nke ọzọ anaghị ahụta isi na ọdụ ya. Agwa ikwu okwu na-efegharị sọsọ n'ikuku bụkwa ihe ọtụtụ mmadụ jiri mara Maazị Kanu na otu Ipob ya. Ndị na-agbasa akụkọ Jubril sị na ọ bụ ntị ya ka ha na-ele, mana nti Buharị nke aka nri na nke aka ekpe ya adịghị otu. Mana foto atọ a gosiri a otu nti Buhari nwere mperi Ihe isii Nnamdi Kanukwuru gosiri na Buhari bụ Jubril nwa Sudan Mana nchọpụta BBC bụ na okwu Kanu a niile bụ ihe avọpụtara n'ikuku makana onye nọ n'Aso Rock ma na-achị Naịjirịa bụ Buhari nke be nna ya bụ Daura dị na steeti Katsina." afirika-49835633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49835633,Anambra Erosion: 'Mbuze na-abọpụtazị ozu eliri na Nnewi',"Mbuze bụ ihe na echere ndị Uruagu Nnewi, Anambra Steeti aka mgba eriela ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ n'ihi na enweghị etu esi echekwa ya bụ mberede ka mgbe ihe karịrị afọ iri na atọ ọmalitere.","Mbuze na-abọpụtazi ozu n'Anambra Ebe mbuze ahụ na-akpa ya bụ mkpamkpa bụ na 100 foot Road, nke na izu uka gara aga mbuze ahụ eriela ụlọ elu abụọ ọzọ ma kewapụ streeti Bank Road na 100 foot Road Nnewi. Mazi Ugochukwu Ndefo, onye Uruagu Nnewi kọwara na ya bụ mbuze malitere ịkpa ike ihe dịka afọ iri atọ gara aga. Mbuze na-agba ndị Uruagu aka mgba Ndefo kọwara na ka mgbe ya bụ nwatakịrị na ya bụ mbuze eriela ụlọ oriri na ọṅụṅụ Ekene Dili Chukwu nwe, rie ụlọ akwụkwọ nakwa ụlọ na ngwa ahịa ndị mmadụ dị ọtụtụ. Ndị bi n'ụzọ 100 Foot na-akọwa na otela ezigbote aka Mbuze a malitere Mbuze bọpụtala ozu eliri Mazi Ifeanyi Nnama kọwara na ụlọ mbụ ya biri na 100 Foot Road Nnewi abụrụla nke mbuze loro kpamkpam. Ọtụtụ ndị bị na ya bụ ebe kọwara na izu ụka abụọ gara aga na mbuze ahụ bọpụtara ozu otu nwoke eliri n' ala ya, nke mere na ndị nwe ya bịara buru ozu ya gaa lie ebe ọzọ. Ka ọ dị ugbua ụzọ sị 100 Foot Road na Nnewi were gaa bank road abrụla nke mbuze kewara abụọ. Ndị niile bị n'ụlọ dị nso na ya bụ mbuze agbaala ọsọ ndụ n'ihi ma ha amaghị mgbe mbuze ahụ ka abịa ọzọ. Ụzọ 100 Foot n'Uruagu bụzị ebe ndi bi na ya chi obi ha n'aka maka mkpa mkpa mbuze Ọtụtụ ụlọ adanyela n'ime Mbuze a. Ụfọdụ no n'ụzọ ịda Ndị ụlọ ha nọ n'ọnụ Mbuze a akwapụla A na-awụnye dọtị n'ime mbuze a Mbuze a etiwala ụzọ 100 Foot abụọ Akụkọ bụ na ihe niile emere maka mbuze arụghị ọrụ Ọtụtụ ụlọ ọrụ na ụlọ ndi mmadu nọ n'okporoụzọ '100 foot' Lekwa mkpa mkpa ndi ọzọ mbuze na-akpa n'Anambara Oraifite: 'Mbuze a anapụla a m ihe niile m ji bụrụ mmadụ' Mbuze achụpụla ndị mmadụ n’ụlọ ha na Nanka" afirika-45384032,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45384032,AMVCA 2018: Lee etu ndị Igbo si nwukee ka anyanwụ,Igbo ndị ọma lee! Igbo ndị a zụrụ ọfụma.,"Okwa unu ma na ebe ọbu na agara ndị Igbo na apụiche maka ọtụtụ ihe ọ kachasị mma ha na ejiji ha. Ngwa lee ụmụafọ Igbo gara ntuturgo AMVCA 2018 nakwa etu ha si ji ejiji na ya bụ emume. 1. Rita Dominic End of Instagram post, 1 2. Ik Ogbonna 3. Alex Ekubo 4. Linda Ejiofor 5. Ngozi Nwosu 6. Lota Chukwu 7. Cynthia Nwadiora 8. Bridget Chigbufue 9. Uti Nwachukwu 10. Chinonso Nina Onyenobi O nwere ndị ọzọ ị na-atụ anya ha?" egwuregwu-43780341,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43780341,Rangers akpanwughị ike ka ha zutere ndị Kwara United,Otu Rangers nke Enugwu akpaghị ike ka-esi tụọ anya mgbe ha zutere ndị Kwara United n'asọmpi NPFL a gbara ụbọchị ụka.,"Ndị otu Lobi Stars bụ ndị nọ n'ọkwa nke mbụ na tebulu NPFL jị pọintị asaa aga ndị otu Rangers nọ n'ọkwa nke asaa N'agbanyeghị na a gbara asọmpi a na be ha n'ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'Enugwu, Rangers enyenwughị goolu ọbụla ka ha na Kwara United na-azọ isi onwe ha zutere ụbọchị ụka. Rangers na Kwara United ji otu otu pọintị gawa ka egwuregwu ha gwụchara, nke mere ka ha na Akwa United na Yobe Stars ka hara na pọintị iri abụọ na atọ. Ndị na-akwado ndị Rangers gbakọtara n'ọgbọ egwuregwu ịhụ ma ndị ha na-akwado a ga-emenye ha obi aṅụrị, mana ha emeghị ihe ndị ha tụwara anya. Cyril Oriaku gbabuuru ndị Rangers bọọlụ oge ha buliri iko NPFL n'afọ 2015/2016 tupu ọ gafee Kwara United Onye nchịkọta ndị Kwara United bụ Bala Abubakar, na ndị egwuregwu ya mere ka agụrụ imeri asọmpi a ọ gụrụ ha, mana otu abụghị n'ezi. Ka agbachara egwuregwu a, Abubakar kwuru ""anyị mere ihe anyị kpara gbasara egwuregwu a o wee gaara anyị ọfụma. Eche m na ihe a gbatara ziri ezi n'etiti otu abụọ a, anyị ga-aga n'ihu gbaa mbọ ịhụ na anyị kpọpụtara onwe anyị n'ime ebe ọnọdụ ọpụpụ a (relegation zone) anyị hụrụ onwe anyị."" Ndị otu Rangers ga-ezute ndị Wikki Tourists nọ n'ọkwa 14 na tebulu n'ụbọchị 29 nke Epreelụ Onye nchịkọta ndị Rangers bụ Gbenga Ogunbote kwuru ""Ihe a bụ ezigbote ndọghachi azụ nye anyị maka na onweghị ihe anyị ji ohere ndị anyị nwetara n'ọkara nke mbụ mee. Mmehie anyị mere n'ọkara ahụ mere anyị arụ n'ọkara nke abụọ. N'ezie, anyị ga-agbalị n'egwuregwu ndị ọzọ iji nweghachịte pọịntị ndị anyị tufuru. Anyị na-arịọ ndị na-akwado anyị ka ha nwee nghọta maka pọịntị abụọ a anyị na-enwetaghị""" afirika-57088948,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57088948,Insecurity in South East Nigeria: 'Ihe kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ ugbua',"Joe Igbokwe, otu onye ọnụ na-eru n'okwu na otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' etiela mkpu na ihe ndị mere n'afọ 1966 nke kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ.","Joe Igbokwe, Ogechi Ikeh, Maazí Toochukwu Ezeoke Igbokwe kwuru nke a na kparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Wenezde. Ndị sonyere na ya bụ mkparịtaụka gụnyere Maazi Toochukwu Ezeoke, Maazị Joe Igbokwe, na nwa ada Ogechi Ikeh. Isiokwu mkparịtaụka a bụ ileba anya na mkpebi ndị gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa wepụtara n'ọgbakọ ha nwere na Delta Steeti n'ụbọchị Tuzde, abalị iri na otu nke ọnwa Mee 2021. Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe Joe Igbokwe, onye ndọrọndọrọ ọchịchị Joe Igbokwe, onye welitara isi na gọọmentị Legọs steeti, gbarụrụ ihu etu e si egbu ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ka ọkụkọ n'ala Igbo. O kwuru na ọ bụ ụdị ihe a mere n'afọ 1966 nke kpatara agha Naịjirịa na Biafra. Igbokwe kwuru, ""Okenye anaghị anọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị. Anyị ma ndị na-egbu ndị uweojii n'ala Igbo. Ọ bụ ndị be anyị na-eme ya."" ""Edeela m akwụkwọ abụọ gbasara agha Biafra, ama m ihe m na-ekwu maka ya."" ""Ọtụtụ ndị mmadụ achọghị ikwu okwu n'ihi ụjọ, ọkwa otu a ka o si mee n'oge ahụ."" 'State Police', 'Vigilante', ga-ebi okwu enweghị nchekwa"" Ndị otu nchekwa nke Anambra steeti a kpọrọ 'Anambra Vigilante Group' N'okwu gbasara nchekwa na Naịjirịa, Igbokwe kwuru na ka ọ dị ugbua na Naịjirịa, Gọvanọ steeti enweghị ikike ịgwa onyeisi uweojii ihe ọ ga-eme na steeti ya. Igbokwe kwuru na ọ bụn'Abuja ka ndị uweojii si anata ikike tupu ha emee ihe ọbụla na steeti ọbụla. ""Naịjirịa buru nnukwu ibu, ọ karịrị ihe otu onye ga-anọ n'Abuja na-ekwu ihe ga-eme,"" Igbokwe kwuru. ""Ọ dị mkpa ka e megharịa ọrụ uweojii ka ndị steeti ọbụla nwee nke ha."" ""Ọ bụrụ na ekewaa ngalaba uweojii Naịjirịa ka mpaghara ọbụla nwee uweojii nke ha, okwu enweghị nchekwa ga-ala kpamkpam. Joe Igbokwe Igbokwe kwukawara na ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-atụ egwu na ndị gọvanọ nwere ike iji ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ ahụ n'oge ntuliaka. ""Mana oge anyị ruru na ya bụ osimiri, anyị ga-ama etu anyị ga-esi gafee ya."" Igbokwe kwukwara na ya kwadoro mmachi ndị gọvanọ machiri ịchịgharị ehi n'ihi na ya bụ ihe amalitela inye nsogbu. Maazị Ezeoke, onye ọnụ na-eru n'okwu Ndị sonyere na mkparịtaụka BBC Igbo nwere gbasara ọgbakọ ndị Gọvanọ Ọdịda Anyanwụ N'okwu ya, Maazị Ezeoke kwuru na dịka gọọmentị machiri ịchịgharị ehi, ọ ga-adịkwa mma ma gọọmentị steeti dị icheiche nye ndị be ha nwere mmasị ịchị ehi nkwado. O kwuru na ọ bụrụ na e mee nke a, ọ ga-emepe ụzọ akụnụba ma mekwaa ka ndị mmadụ nwee ọrụ. Ezeoke kwuru sị: ""Ọ bụrụ na e nwee ohere ebe ndị mmad ụ nwere ike ịga n'ụlọakụ gbazite ego iji malite ịzụ ehi, ọ ga-amagbu onwe ya."" ""Ọ bụrụ na e bido ịzụ ehi n'ogige (ranch) ọ ga-emepe atụmatụ ahị dị icheiche."" ""A ga-enwe ndị ọrụ ha bụ ịkọpụta nri ehi, ụfọdụ amaghị na ọ bụ nnukwu ahịa nwere ike inye mmadụ nnukwu ego."" Ezeoke kwadokwara atụmatụ 'State police', ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na ndị gọvanọ ga-eji ya mekpaa ndị iro ha ahụ. Ogechi Ikeh, onye ọgbambọ maka ikike dịrị onye Ogechi Ikeh tụrụ arịrị na a na-egbusi ndị uweojii na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ aghara aghara nke o kwuru ga-eme ụfọdụ ụmụnwaanyị ajadu, mekwa ụmụ ha ndị enwenna. O kwuru na otu ihe so eweta enweghị nchekwa bụ na gọọmentị anaghị akpachapụrụ ndị ọrụ nchekwa anya. O kwuru na ""ndị uweojii na-etinye onwe ha n'ihe ize ndụ iji hụ na ha chekwara ndụ ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka gọọmentị na-elebara ha anya."" ""A gụchaa ndị ọrụ ahụike na ndị nkuzi, ndị ọzọ e kwesịrị ịkpọ mkpa bụ ndị uweojii, n'ihi na ọrụ ha bụ ichekwa ndụ ndị mmadụ."" ""Ọ bụrụ na di m bụ onye uweojii, aga m na-achị obi m n'aka oge niile."" ""Ya mere, ọ ga-adị mma ma gọọmentị steeti dị icheiche inwe ego ha mapụtara uche iji na-elebara ndị uweojii anya ma na-akwụ ha ezigbo ụgwọ.""" afirika-47955931,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47955931,Onye ọbụla nara ụtụisi n'ahịa a ga-akpụpụ ya ụlọikpe - Adinuba,Kọmishona mgbasa ozi dị n'aka n'Anambra steeti bụ Gideon Chukwuemeka Adinuba ekwusiele ike na onye ọbụla nara ndị ahịa ụtụisi n'ahịa ọbụla na steeti ahụ ga-aga mkpọrọ.,"Adinauba sị na ""ndị dị otu a na-etinye ndị mmadụ n'oke ahụhụ nke gọọmenti achọghị ma ọlị"". Ọ kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC ebe ọ sị na ""onweghị onye nwere ikike ịna ụtụisi na-abụghị gọọmenti"". Atụọla ihe karịrị mmadụ 75 mkpọrọ maka ịtịnye aka na ụdị ọrụ a. Ụnyahụ Kọmịshọna okwu ahịa dị n'aka gosiri ọha ndị ha kpọpụụrụ ndị ụweojii bụ ndị ha sị na-ana ụtụisi n'ahịa Ekwulobia dị n'Okpuruọchịchị Agụata. N'aka ọzọ, Kọmishona mgbasa ozi sị na ""oteela aka arịọwara ndị na-akpa ụdị agwa a ha sepụ aka ya bụ enwe n'ofe"", mana ha nyụrụ ntị mmanụ. Uzochukwu Ozumba bụ onye okaikpe kwukwara na n'ezie ""ọnwekwara ahịa ụfọdụ ndị obodo rụrụ, ọ ga-adị njọ isi ndị obodo ahụ anatala ụtụisi na ya bụ ahịa"". Mana Ozumba kwetere na gọọmenti nwere ikike ịkwụsị onye ọbụla gara ịnata ụtụisi n'ahịa ọ rụghị. Ọ sịkwa na gọọmenti nwekwara ikike itinye anya n'ahịa ndị obodo rụrụ mana ""okwesighị ekwesi gọọmentị ịkwusị ndị obodo ha anatala ụtụ n'ahịa ha rụrụ"". Okwusiri ike na gọọmentị kwesiri ị kpọpụta ndị gana anakọtara ha ụtụ n'ahịa ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45068260,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45068260,Babatunde Fashola sị na Naịjirịa na ayọrịbazi egwu maka ọkụ latrik,"Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọkụ latrik a na-emepụta na Naịjirịa agbagotela ruo megawatt puku asaa.","Otela ndị Naịjirịa na-eti mkpụ maka ọkụ adịghị Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti ụnyaahụ. Fashola nọ na Kalaba ebe ndị isi ọrụ na ngalaba ọ na-achị na-eme nzukọ. O kwuru na agbanyeghi na ọrụ fọdụrụ ka nkụ, ngalaba ya agbanyela ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa karịa etu ọ dị mgbe ha malitere ọru n'afọ 2015. Fashola jị ngalaba atọ achịkọtara ọnụ na gọọmentị Buhari ""Afọ ato gara aga, akukọ bụ na mmepụta ọkụ latrik bụ nnukwu nsogbu anyị nwere na Naijirịa. Mgbe ahụ, ndị na-eke ọkụ na-ekwu na ha enweghị nke ha ga-ekenye ụmụ Naịjirịa. ""Mgbe ahụ, anyị na-eke ""megawatt"" 2,690 nye ndị Naịjirịa, mana akụkọ ahụ agbanwela. Ihe anyị nwere ike ugbua bụ megawat 5,222, nke bụ nke kachasị kamgbe Naịjirịa pụtara. ""Ugbua, ihe a na-emepụta bụ megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. Nsogbu ka dịkwa, mana anyi ga-ekwu na anyị na-aga n'ihu. E nweghị ọkụ na-emebiri anyị ihe Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46176550,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46176550,Imo State: Nwuchi Uzodinma abụghị ndọrọndọrọ ọchịchị - Obono-Obla,Onyeisi ndị ọrụ pụrụiche n'iweghachị akụnaụba ọha bụ Okoi Obono-Obla ekwuola na ha nwụchiri Hope Uzodimma makana oteela achụwara ya maka mmerụaka o mere.,"Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 Obla kwuru na ọ bụghị maka na ọ bụrụla onye ahọpụtara ịzọ oche gọvanọ n'Imo steeti dịka ndị mmadụ sị eche. O kwuru na ya ndị otu ya nwetere kepukepu na Uzodimma na-aga njem wee jee nwuchie ya n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja. Obla kwuru na o nweghị ebe ọ bụla iwu kwuru na ị gaghị anwụchinwu onye ọ bụla aka ya adịghị ọcha mgbe maọbụ ebe ọbụla ọ nọ. Cheta na ndị ọrụ pụrụiche n'iweghachị akụnaụba ọha kwuru na ha nwụchiri Hope Uzodinma n'abalị iri na otu ọnwa Nọvemba afọ 2018 n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja. Onyeisioche ndị ọrụ a bụ Okoi Obono-Obla n'ozi o zigara onye ntaakụkọ Punch kwuru na a nwụchiri Uzodinma n'ihi arụghị ọrụ ngo ọnụ ego ya dị nde dọla iri na abụọ nke ụlọọrụ ya natara ndị Nigerian Ports Authority nke bụ maka igu ọwa mmiri na Calabar. N'otu aka ahụ BBC Igbo kpọrọ Hope Uzodinma na onye ndụmọdụ ya n'ekwentị mana o nweghi onye n'ime ha zara ekwentị ha. BBC Igbo Kpọrọ onyeisioche APC n'Imo Steeti bụ Dan Nwafor o kwuru na ọ nụbeghi maka akụkọ mwụchi ahụ ebe odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ FCC jones kwuru na nke a bụ eziokwu. Jones kwukwara na APC anaghị akwado mpụ na nrụrụaka na ọ dị mma ka Uzodinma ga zara ọnụ ya n'aka ndị ọrụ nyocha. Ọ gara n'ihu kwuo na aka gọvanọ Rochas adịghị na mwuchi a nwụchiri Hope Uzodinma. Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha Onyeisioche a kwuru na Uzodinma na-agbanarị mwụchi a kamgbe otu afọ gara aga ma rue elekere asatọ nke abalị ụnyaahụ mgbe ha nwụchiri ya. N'okwu ya ""N'ihe dịka nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke abalịa, ndị ọrụ onyeisiala n'iweghachị akụnaụba ọha nwụchiri Hope Uzodinma ji aha APC azọkwa gọvanọ n'Imo Steeti n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja dịka o so ụgbọelu Air Peace akara P47324 bata si Legọs. ""Ụlọọrụ a na-enyocha ebubo mpụ megide Sịnetọ Uzodinma nke si n'ọdịda ụlọọrụ ya ịrụ ọrụ ngo ego dị nde dọla iri na abụọ maka igu ọwa mmiri na Calabar."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52830961,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52830961,Okwu nhibe 'vigilante' n'Ọwụwa Anyanwụ ọ bịara na mmezu?,Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na onyeisi ndị uweojii enweela nkwekọrịta maka usoro a ga-eji hiwe otu nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ.,"Ndị otu 'Forest Rangers' nke Enugu steeti Nkwekọrịta a gunyere na o bụ ndị uweojii ga-akụzịri ndị ahọpụtara ọrụ a. Nke a na-eme dịka onyeisi nzụkọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Gọvanọ Dave Umahi na Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Mohammed Adamu nwere nzụkọ n'ekwe nti. Umahi kwuru sị "" Onyeisi ndị uweojii nke Naijirịa bụ Adamu na ndị gọvanọ ise nke ọwụwa anyanwụ ma onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo nwere mkparịta ụka maka otu nchekwa a. ndị ọzọ sonyere anyi bụ Emmanuel Iwuanyanwu. Jim Nwobodo na ụfọdụ ndị Eze odinala"". Umahi kwuru na ndị Gọvanọ ọwụwa anyawnụ niile sọ na ya bụ nkwekọrịta ma kọwaa na otu nchekwa ndị a ga-aga n'ime obodo maka nchekwa. Etu o siri bido Dịka izuụka ole na ole ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ bidoro ọtụ nchekwa nke ha ha kpọrọ ""Ameotekun"" n'ọnwa Janụarị afọ 2020 maka nwakpo ha sị na ndị ọchi ehi na-awakpo ndị nọ n'ime obodo. Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ zutere ma nye ndị ụlọomeiwu ikike iwepụta iwu ga-akwado iwepụta otu nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ. Nke a dị mkpa n'ihi na iwu Naijirịa akwadoghị ndị nchekwa ọzọ ma ọ bụghị ndị uweojii. Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ zọpụrụ njem maka okwu a ma nwee nzụkọ ha na Adamu maka ihiwe otu nchekwa a. Ndị kọmịshọna uweojii depụtara akwụkwọ nke gosiri usoro a ga-eji hiwe ya bụ otu. Kama ndị gọvanọ ọwụwa anywnụ anabataghị ya n'ihi na ha sị na ọ bụghị ihe ha na onyeisi ha kpara. Onye na-ahu maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji kọwara BBCIgbo etu ihe siri gaa. Orji sị "" ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ anabataghị usoro ndị uweojii wepụtara na mbụ n'ihi na ndị Kọmịshọna uweojii ji aka ha tinye ndị ga-anọ na ngalaba na-elekọta ndị otu nchekwa a"". Orji kọwara na nke a mere ka onyeisi ndị uweojii bụ kwuo na ọ bụ eziokwu ka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-ekwu. O kwuru sị "" Onyeisi ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu n'ihi na ihe ya na ndị gọvanọ kpara bụ ka ndị gọvanọ gaa n'ime obodo ma ghọpụta ndị ga-eso mee nchekwa a"". Dịka ọ dị ugbu a, ọ bụ otu iwu ga-achịkọta steeti niile nọ n'ọwụwa anyanwụ maka nke a. Ufodu ihe so n'usoro a" afirika-51225155,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51225155,Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ọrịa abụọ a ji yie onwe ha,Ọrịa abụọ na-akpọtụ ugbua bụ ọrịa Coronavirus nakwa ịba Lassa.,"Ụjọ ji ụmụ Naijiria maka ọrịa a n'ihi egwu na ọrịa abụọ nwere ike iifesaa na ala Naijiria. Coronavirus bụ ajọ ọrịa na-efe efe nke a na-ebute n'ikuku na-emetụta akụkụ ahụ e ji ume ma nwekwa ike igbu onye o ji na-egbughị oge. Nke mgbe o bidoro na ngwụcha afọ 2019 rue Jenụwarị 2020, ọrịa egbuola mmadụ karịrị otu nari ebe mmadụ karịrị puku asaa buterela ya, nke ọtụtụ n'ime ha bụ na mba China. N'aka nke ọzọ, Iba lassa bụ ọrịa na-efe efe nke a na-ebute site n'iri ihe oke bụ ọrịa ahụ metụrụ ọnụ maọbụ nyụnye nsị maọbụ mammiri. Ọrịa Lassa atala isi mmadụ 11 na steeti dị 11 na Naijiria. Ebe Conoravirus na Lassa siri yie onwe ha Njirimara Conoravirus Dịka WHO siri kọwa na websait ha, njirimara onye Conoravirus ji gụnyere Njirimara Ịba Lassa Ịba Lassa na-eji ahụọkụ na ike ọgwụgwụ abịa nke mere na ọtụtụ na-eche na ọ bụ ịba. Njirimara ndị ọzọ dịka WHO siri kọwaa gụnyere: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44651338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44651338,Abaribe: Ihe DSS jiri kpọchịe m',Onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara ndịdị anyanwụ Abia Steeti bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe mere ndị ụlọọrụ nchekwa puruiche eji DSS mara ji nwụchie ya.,"Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi. O kwuru na ọ bụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị riri unyi nke Pati All Peoples Congress (APC) na-eme. Abaribe kwuru ihe a unyaahụ n'isi ụlọọrụ ndị otu pati People Democratic Party (PDP). Ọ rụtụrụ aka na ndị ụlọomeiwu niile nọ zi n'ihe ize ndụ maka nta ndị isi ọchịchị na-achụso ha. O kwuru na etu ụlọọrụ INEC ga-esi rụọ ọrụ na ntuliaka 2019 bụ ihe ga-egosi ma Naịjirịa ọ ga-adịgide na ngwụcha ntuliaka ahụ. N'okwu ya ""Ihe niile ha na-eme ugbua bụ i yi ndị mmadụ egwu, ịhụ na ha mechiri ọnụ ndị na-ekwu okwu megide ha. ""Ụlọomeiwu bụ nke m so n'ime ya bụ ebe ha na-awakpo, e si na nke onyeisi ụlọomeiwu baa na nke Sịnetọ Melaye rue na nke Shehu Sani, ugbua bụ nke m"". Abaribe gara n'ihu si: ""Ihe m nwereike ị gwa ndị Naịjirịa bụ ka onye ọbụla jide akwụkwọ nbianye aka ị chụpụ gọọmentị na-achị ugbua"". ""Gọọmentị a bụzi maka mmegbu ndị mmadụ, onweghi ụzọ ọzọ enwereike iji mme ya"". Abaribe kwuru na anwụchiri ya ma nyocha ụlọ ya n'ahi na ọ bụ onye nkwado ndị na-eyi ndụ egwu. O kwuru na onye dị njikere na gọọmentị ga-achọ otu ihe konye gị n'isi iji mebie aha gị. BBC Igbo na Abaribe nwebụruụ mkparitaụka n'afọ a, ebe ọ nọ kwuo na ndị Igbo na ewere gọọmenti etiti iwe maka agwa ọjọ ha che na a na-akpasi ha. Gee okwu ya ebe, nakwa n'elu. Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44313465,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44313465,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Kim Yong-Chol abatala Amerịka,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Anwụch ị r ị ndị chọrọ ime ngagharị iwe n'Enugu,"Ndị na-akwado Biafra mere 'onye nọrọ na be ya' iji cheta ụbọchị ehibere Biafra n'afọ 1967 nakwa ndị nwụrụ n'agha Naịjirịa na Biafra Ndị uweojii anwụchiela mmadụ iri abụọ ha kpọrọ ndị otu Biafra Zionists Federation, gụnyere onye isi ha a na-akpọ ọkaiwu Benjamin onwuka n'Enugwu ụnyaahụ. Ha nwụchiri ndị a mgbe ha chọrọ iji aka ike banye n'ogige ụlọ gọọmentị Enugwu Aka akparala ndị ọkwa ha gbagotere na Kaduna Ndị EFCC anwụchiela Alhaji Ramalan Yero wụbụ gọvanọ ndị Kaduna, Abubakar Gaya-Haruna bụbu onyeisioche ndị PDP, Hamza Ishaq bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Kaduna nakwa Nuhu Somo bụbu minista. A nwụchiri ha maka ebubo mmerụaka gbasara nde Naịra narị asaa na iri ise so n'ego ndị PDP ji mee mgbasaozi na ndọrọndọrọ ọchịchị 2015. Akụkọ mba ofesi; Tupu KimYong-Chol abịa Amerịka n'afọ a, amachiburu ya ibata Aka Ikenga Kim Jong-Un bụ onyeisiala mba North Korea na Mike Pompeo bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta Amerịka na mba ofesi, ezukọọla na New York. Ọbịbịa Kim Yong-Chol ga-eme ya mbụ onye ọkwa ya gbagotere na North Korea ga-abịa Amerịka n'ime ihe ruru afọ iri abụọ. N'egwuregwu Carl Ikeme ritere ihe akpọrọ 'ọkacha agba n'egwuregwu' mgbe Naịjirịa malitere njem iko mba ụwa Onye nchịkọta ndị otu Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuru na Ikeme nwere ike iso ha aga iko mbaụwa na Rọshịa ma bụrụkwa onye otu ha a na-akwanyere ugwu. Cheta na a chọtara ọrịa Leukaemia n'ahụ Ikeme bụ aka na-echere Naịjirịa goolu, n'afọ gara aga. Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu" afirika-54935871,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54935871,Kedụ ndị bu ụzọ tụgharịa 'Bible' n'asụsụ Igbo?,Okwukwe ndị ofufe nke Kraịst bụ n'akwụkwọ nsọ ka o hiwere.,"Martin Luther bụ onye mbụ mere ka akwụkwọ nsọ rụo ndị nkịti aka. Ndị Igbo nwere akwụkwọ nsọ nke e dere n'asụsụ Igbo ha na-eji aka ụka mgbe ọbụla ha zụgọrọ maka nkea. Kama ọtụtụ ndị mmadụ mamaghị ọnye tụgharịri ya bu akwukwọ nsọ n'asụsụ Igbo. Akụkọ a ga-agwa gị onye dere akwụkwọ nso n'asụsu Igbo. Anyị kpọtụrụ ụkọchukwu Chika Okpalaike ọnye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ofufe ka ọ tinyere anyị ụche ma gwa anyị eziokwu opnye ọ bụ ya dere akwụkwọ nsọ. Onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ Igbo? Chika Okpalike kọwara na ajụju ndị mmadụ kwesịrị ị na-ajụ abụghi 'Onye tụgharịrị akwụkwọ nso n'igbo?' kama ihe ha kwesiri ịjụ bụ, 'Kedu akwụkwọ nsọ nke atụgharịrị N'Igbo?'. Okpalike mere ka anyị ghọta na e nwere ọtụtu akwụkwo nso dị iche iche. Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala? Kedụ etu akwụkwọ nsọ si bido? Okpalike kọwara na ọ bụ n'ihe dịka afọ 400 ka achịkọtara akwụkwọ ndi dị iche iche were kpọọ ya akwụkwọ nsọ. N'Ime akwụkwọ nsọ a nke agba ọhụrụ bụ New Testament n'okwu bekee bụ n'asụsụ Grik ka eji dee ya nke ha kpọrọ Septuagint. Septuagint bụ agba akwụkwọ nsọ nke ndị Juu na anọghi n'ala nna ha bụ Israel. Ọ kọwara na ọ bụ Pọọl dere ọtụtu n'ime akwụkwọ nsọ nke agba ọhụrụ nke ọ jị Grik egbujiri egbuji nke a kpọrọ Koine greek. Mgbe ndị nzụkọ nke Kraịst bịakọtara were si na ha chọrọ akwụkwọ ofufe nke ga-anọgide na enweghị mgbanwe ka ha hiwere akwụkwọ nsọ nke ha kpọrọ Septuagint. Agba akwụkwọ nsọ nke Septuagint atụgharịrị n'okwu latin bụ Vulgate. Gịnị mere n'oge afọ ndi 1600? Ụkọchukwu Martin Luther bụ onye mbụ tụgharịrị akwụkwọ nsọ n'asụsụ ndị. Ọ tụgharịrị ya n'asụsụ ndị Jamani. Kama ọtụgharịghị nke Septuagint kama ọ bụ nke Masoretic ọ tugharịrị. Masoretic bụ akwụkwọ nsọ nke ndị Juu nke fọdụrụ dịka alụchara agha ma mgbe a dọọrọ ha n'agha gaa mba ọzọ. Gịnị bụ ọfọ? Martin Luther tụgharịrị Masoretic text n'ihi na o kwuru na ọ bụ nke ahụ ka Jịsọs gụrụ oge ọ nọ n'ụwa. Ewepụ nke a, akwụkwọ nso bụ nanị n'asụsu Grik maọbụ latin ka ọ dị na mbụ. Nkea mere ka ọtụtụ nke mmadụ bido na-atụharị akwụkwọ nso n'asụsụ obodo ha nke gụnyere okwu Bekee. Kedụ akwụkwọ nso bu ụzọ bata ala Igbo? Akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bu akwụịkwọ nso nke e dere n'asụsụ bekee bụ nke mbụ batara ala Igbo. Ọ bụ ndị na-ewete ozi ọma bụ ndị Protestant nke Martin Luther bidoro bụ ndị mbụ batara ala Igbo ịzisa ozi ọma. Mgbe ndị ụka Katolịk bịara ala Igbo, ọ bụ nke Vulgate atụgharịrị n'asụsu bekee ka ha jiri bịa. Nkea pụtara na ọtụtụ akwụkwọ nso atụgharịrị bụ nke Masoretic. Akwụkwọ nso bu ụzọ bata Naijirịa bụ nke Masoretic ma bụru kwa akwụkwọ nsọ mbụ atụgharịrị n'asụsụ Igbo. Ndị ole tụgharịrị akwụkwọ nso n'asụsụ Igbo? Chika Okpalike kwuru sị, ""Ọ bụ Ajayi Crowther na John Taylor dịkọrọ aka ọnụ were tugharịa akwụkwọ nsọ nke Masoretic n'asụsu Igbo"". Ọ kọwara na Crowther tụgharịrị akwụkwọ Abụọma ebe Taylor tinyere uche n'akwụkwo nke Pọọl. Dịka o si kọwaa, ọ bụ ndị ụka Protestant tụgharịrị akwụkwọ nsọ nke Masoretic. Kedụ mgbe ndị Katolịk tugharịrị akwụkwọ nsọ Vulgate na Septuagint n'asụsu Igbo? Ndị ụka katolịk na ndị nke Protestant nwere nkwekọrịta ịtụgharị akwụkwo nsọ n'asụsụ Igbo. Okpalike kwuru sị, ""ọ bụ ndị nke ụka Protestant ga-ede nke 'New Testament' ebe ndị katolịk ga-ede nke 'Old Testament'. Kama ndị ụka protestant dechara nke ha mana ndọ katolịk edechaghị nke ha n'oge. Ọ bụ ya mere ndị preotestant ji ewpụta nke ha kpọrọ 'Agba Ọhụrụ'. Okpalike kwuru na ọ bụ nkea mere ruo taa a na-akpọ 'New Testament' Agba ọhụrụ. Emume 'Olili ọnwa isa' Eziagulu Aguleri nke afọ 2020 kporo ọkụ, Kirie ka o si gaa Ọ bụ n'ihe dịka afọ 1999 maọbụ 2000 ka ndị ụka katolịk wepụtara akwụkwọ nsọ Septuagint ha tụgharịrị n'asụsu Igbo. Kedụ ndị tụgharịrị akwụkwọ nsọ nke Septuagint n'asụsụ Igbo? Ụkọchukwu Chika Okpalike kwuru sị, ""Ọtụtụ ndị mmadụ so tụgharịa akwụkwọ nsọ nke ndị Katọlịk nke Ụkọchukwu na Ọkammụta Christopher Amamgbo Ifenatuorah no n'isi ya. Ọtụtu ndị nyeere ya aka gụnyere mu onwe m."" Ọtụtụ ndị ọkammụta si mpaghara dị iche iche soro tụgharịa ya bụ akwụkwọ. 'Ọ bụ n'akwụkwọ nke Septuagint na nke Vulgate ka anyị si tụgharịa ya', Chika Okpalike." afirika-43368561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43368561,Frank Wolf sị na oge erụola mgbe a ga-etinye anya na Boko Haram,Mgbe mbụ ndị mba Amerika na-etinye anya na mkpamkpa ndị ọmekataraihepuujọ na-akpa na Naịjirịa bụ n'onwa nke anọ (April) 2014.,"Frank Wolf kwuru n'ihe karịrị mmadụ 30,000 gbara ọsọ ndụ si Naịjirịa gbafee Europe n'afọ 2016 Mgbe ahụ ka chi jiri n'ehihie n'anya ụmụakwụkwọ 276 ndị ọjọọ tọọrọ na Chibok, nke ọtụtụ n'ime ha bụ otu Kristi. Nke a mere ka mba niile bido kwuwe maka ha. Ụzọ mgbasaozi soshal midia nwuru ọkụ maka akụkọ gbasara ụmụaka ahụ. Mgbe ahụ ka e bidoro nụwa maka ""BringBackOur Girls"". Ndị otu ""BringBackOurGirls"" che na ha emeriela rụọ mgbe atọọrọ mmadụ 110 na Dapchị Ndị niile ọnụ na-erụ n'okwu n'uwa dika nwunye onyeisiala mba Amerika mgbe ahụ bụ Michelle Obama bidoro bugheriwe akwụkwọ e biri ""BringBackOur Girls"". Ndị ọrụ na-eme ihe ejije na Hollywood batakwara na ya mgbe ahụ. Dịka nta akụkọ kwuru na-mgbe a na-eme ihe a, ọtutụ a chọpụtabeghị mmekpe ahụ dịrị ndị otu Kristi na Naịjirịa, ọkachasị ndị bị n'ugwuawusa ya na mkpa Naịjịrịa dị na mba Afrịka. Ka nke a mechere, akụkọ ndị ọzọ maka arụrụala ndị ọmekataraihepụụjọ na arụsa ndị otu Kristi, ya na ka ndụ ha siri bere ebere na-aka ndị ọjọọ na Naịjirịa bidoro batawa ndị mba ofesi ntị. Akwụkwọ akụkọ Eurasia Review dere na otu onye otu Kristi bi n'Ugwuawusa dere akwụkwọ ozi si na ""ugbua bụ oge ọnwụnwa dịrị ndị otu Kristi, ọ kachasị ndị bị na Ugwuawusa"". Ọ bụrụ na atọghị ụmụ ha na Chibok, ọbụrụ na Dapchi ebe ndị ọjọọ kpatara ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110. Ma nke a emeghị, ọbụrụ na a na-atọgharị ụmụaka ha na-ike ka ha fewe chi ndị alakuba ma mee ka ha luwa ndị otu ha dịka ha mere na Kaduna Steeti. Ma ọ bụ e gbuo ha ka ọkụkọ n'aka ndị na chị ehị dika ọ dị na Benue Steeti ebe egburu mmadụ dị 73 na obodo ha. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na-agbanyeghị na ndị otu Kristi ekweghịekwe, mana ""ha chọrọ enye m aka nkwankwa"". Ọ sịkwa na-onwebeghị ezigbo ihe ndị gọọmenti Naịjirịa megoro ihụ na e bere ya hụ ogbugbu a an egbu ndị otu Krisiti. Ndị agha Naịjirịa na e kwukwa na e memiela ndị Boko Haram. N'izu gara aga, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na Plateu Steeti na ya a dịla njikere ị kwusị ọgụ niile na-ada na Naịjiria. N'aka nke ọzọ, onye ọmeiwu n'ụlọnta ọmeiwu nke mba Amerika na-anọchitebụ anya ndị Virginia bụrụkwa onye na-kwuchitere ndị enweghị ka ọ ha ha bụ Frank Wolf kwuru ihe anya ya hụrụ mgbe ya gara Naịjirịa n'afọ gara aga. Ọ kwuru na oge eruola mgbe ndị mba ụwa ga a kwanye gọọmenti Naịjiria ọkụ n'ike ka ha gbaa mbọ kwụsị arụrụala niile ndị Boko Haram nakwan nke ndị na achị ehi na-arusa ndị mmadụ n'obodo ahụ. Okwuru na Naịjiria bụ mba kachasị ọnụọgụ na Afrịka. Ya kpatara na ịhe ọbụla metutara Naịjirịa ga-emetu mba uwa, maka n'anya bewe, imi ebewe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50584006,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50584006,London Bridge Incident: Otu onye anwụọla na mwakpo a,Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na mwakpo mere na London Bridge nke mba Briten.,"Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na mba ahụ na-eme nyocha akpọọla ya mwakpo otu ndị na-eyi ndụ egwu. Praịm Minista mba ahụ bụ Boris Johnson ekelela ndị ọrụ gbata gbata maka enyemaka ha ma zigara ndị merụrụ ahụ ozi itiakanobi. End of Twitter post, 1 Okporo mmanụ ọhụrụ na-abịa Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na a ga-ebido ọrụrụ okporo mmanụ agbịdị ga-esi Ajaokuta dị na Kogi steeti rue Kano. O kwuru nke a n'ọgbakọ mba ndị na-ebupu mmanụ agbidị nke na-eme ugbua n'Equatorial Guinea. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akwụkwọ nsọ amachighi 'plastic surgery' - Tony Rapu Ụmụnwaayị ụfọdụ na-etinye ihe ike ka ewere chọọ mma Onye ama ama n'atụmatu inyere ndị nwere nsogbu aka bụkwa ukọchukwu bụ Tony Rapu enyerela ndị mmadu ihe ha ga-eji mee mkpọtu na soshal midia Ụkọchukwu Rapu sị na akwụkwọ nsọ ndị ofufe kraịst akatọghị ndị mmadụ ime ha Bekee kpọrọ ""Plastic Surgery"". Mana, ọ sịkwa n'ọbụ mma nke mụọ ka mma. Rapu sị na ihe mere bụ na o nweghi ihe o chere dị njọ ma mmadụ chọrọ mma maọbu gbanwe onwe ya. Ọ bụ n'akara Instagram ya ka Ukọchukwu Rapu tinyere okwu a. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Burn survivor: Onye nwere apa gbalịa nabata ya - Kay Obum" egwuregwu-44685824,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44685824,World Cup 2018: France ọ bụ mba Afrịka maka mgbapụ Argentina?,Mgbapụ Ajentina gbapụrụ otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'Iko Mbaụwa emeela ka ndị Naịjirịa na-ekwu na Frans bụ ndị Afrịka.,"Ka Naịjirịa pụrụ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 n'ụzọ ọtụtụ kwuru na o doghị anya, ndị mmadụ si mpaghara Afrịka, ọkachasị ndị Naịjirịa, ṅụrụ iyi ikwado Frans ka nyụọ Ajentina ịkpakwụ. Frans mechara jiri ọkpụ anọ asatara atọ (4-3) merie ma gbapụ Ajentina na ya bụ asọmpi. Ndị mmadụ bidoro ikwu na Frans bụ mba nke isii Afrịka du bịa asọmpi a. Ebe o si ka mma bụ na ọtụtụ ndị na-agbara Frans bọọlụ bụ ndị nne na nna ha bụ ndị Afrịka ma mụọ ha na Frans. Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter. @KnoxTainment depụtara aha ndị si mpaghara Afrịka na-agbara Frans bọọlụ iji gosipụta etu o si hụchata ya na mba Frans bụ mba Afrịka nke isii bịara Iko Mbaụwa nke 2018. Onye ọzọ bụ @iamBussmarn depụtakwara aha ndị ọzọ na-agbakwara mba Frans bụ ndị Afrịka. Onye ọzọ bụ @GH_ILUV kwuru sị na otu Afrịka (ya bụ Frans) chụrụ Ajentina maka ịghọgbu Naịjirịa. @Nasawali_phame kelere Frans maka ""ịnọchite anya mpaghara Afrịka ọfụma"". @Nani_Ras kwuru na mmeri Frans bụ mmeri Afrịka. BBC Igbo nwere olileanya na ndị Afịrịka ga-akwado ndị isi ojii ndị ọzọ wee dee maka ụmụ Afrịka na-agbara ndị mgba ọzọ bọọlụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51186868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186868,"Igbo foods: Lee nri ndị e riri oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua","Nri dị ezigbote mkpa nye ndị dị ndụ, mere na ọtụtụ ga-ejinwu ihe ọbụla ọ dị ha ka ọ ga-abanwu n'afọ mere nri.","N'ụwa ugbua, ọtụtụ ndị e nweela ikike ịhọ nri ha ga-eri, ebe ị ga-anụ ""ana m eri ji, anaghị m eri ede"". Mana oge agha Biafra, n'ihi etu o si raa ahụ inweta nri, ndị mmadụ riri ihe ọbụla ha hụrụ, ma ọ dị ahụ ha mma ma ọ dị njọ. Ihe mere bụ na ka agha gachara, ndị Igbo bịara were nri ndị a tụgharịchaa ya, na-esiputa ya etu ọ ga-esi na-atọ ụtọ n'ọnụ. Lee ụfọdụ nri ndị Igbo malitere iri mgbe gboo na ụzọ e si eri ha ugbua: 1) Akpụ (ji akpụ) N'oge agha, a na-abacha azụ akpụ, saa ya mmiri were mmanụ na ụgba gwọọ ya tupu e rie ya Akọwa akụkọ mgbe gboo ghara ịkpọpụta akpụ, mara na onye na-akọ akụkọ ahụ bụ nwa a mụrụ taa. Akpụ bụ nri e nwereike ịkpọ 'ọzọ Igbo ndụ' maka etu e si eri ya mgbe gboo, ọkachasị mgbe agha Biafra bidoro. Nke bụ na oge agha, ndị mmadụ nọ na-eri akpụ na-abaghị ya na mmiri (bụ etu e si eme ya ugbua tupu e rie ya). Ugbua, a na-eri akpụ n'ụzọ dị iche gụnyere ịkwọ garị, abacha, ime eberebe jiakpụ, akara jiakpụ, wdgz. Akara jiakpụ bụ akpụ e ji mmanụ nri ghee nke etinyere nnu na ose 2) Ji Akụkọ ji dịka nwanne ya bụ akpụ (a ga-akpọ otu aha ghara ịkpọta nke ọzọ)? Ji so n'ihe ndị zọrọ igbo ndụ oge gboo ma n'oge agha, ma soro kwa na nri ndị Igbo anaghị eji egwu egwu ugbua. E nweela ụzọ dị iche iche e si emepụta ji maka oriri. A na-asụ ya asụ eji eri ofe, a na-aghụ ya n'ọkụ jiri mmanụ nri rie ya, a na-esikwa ya esi jiri mmanụ nri, ji agwọrọ agwọ, nke eghere eghe, stuu nakwa ihe dị iche iche eri ya. A na-eji ji a ghụrụ aghụ akwa ọbịa 3) Ero Oge gboo, ụfọdụ na-eji ero emere anụ, mana ugbua, ọtụtụ na-eji ya emere ihe e ji atagharị ọnụ n'ime ofe n'agbanyeghi na anụ ga-adịkwa n'ofe ahụ. E nwere ọtụtụ ero dị iche iche, mana ọ bụghị ero niile dị mma oriri Ero na-atọ ụtọ n'ofe mana ọ bụghị ha niile dị mma itinye n'ọnụ, nke a mere na onye amaghị anya ero ekwesịghị ịkpata ero n'ọhịa. E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya, ero nnọọhịa, atakata e loo nakwa ndị nke dị iche iche. O so na nri ndị zọrọ Igbo ndụ, mana ugbua ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-amasị iri ya. Ka ọ dị ugbua, ọ bụghịdị nwaafọ Igbo niile a mụrụ site n'ihe dị ka afọ 1990 ruo ugbua detụrụla ya ọnụ. 4) Ede: N'oge agha, ụfọdụ ndị mmadụ ji akwụkwọ ede mere akwụkwọ nri ha ji agwọ ji Mana ọ dị ka ịchọta agbụsị n'ime akpa nnu ịhụ onye ka na-eji akwụkwọ ede esi ofe ugbua. N'aka ọzọ, mkpụrụ ede na onwe ya bụ ihe na-aga ahịa ma ruo ugbua, dịka a na-eji ya eme ụrị na-eme ka ofe rọọ arọ, ebe a na-eri ụfọdụ n'ime ya eri. Ugbua a na-esi ede esi rie ya etu e si eri ji. A na-esi ede agwọrọ agwọ, ụfọdụ ndị na-eghe ya eghe na-ata ka ihe ntagharị ọnụ a kpọrọ 'cocoyam chips' n'olu Bekee. 5) Akwụkwọ nri: Ụfọdụ akwụkwọ nri ndị Igbo na-eri ugbua malitere oge agha, mgbe nri kọrọ ezigbo ụkọ. Ọtụtụ bụ ndị ha siri na-ejighi nnu na ose, mana ugbua a na-akwọ aka sie akwụkwọ nri ndị a tinye ma anụ ma azụ, ọ na-atọwa ntị. Akụkwọ nri ndị dị ka 'ucheakọrọ' (o yiri akwụkwọ akpụ) bụ nke ọ na-abụ a gbachaa ya n'anwụ ka ọ ghara ịgbarisi, a fọọ ya afọọ ka ọ dị ka onugbu tupu e were ogiri na azụ na ose sie ya. Ọzọ bụkwa nke a ma dịka 'okwe oyibo' (a na-eji ya dịka ụgụ) e ji ya esi ofe egwusi na nke a ma dịka 'ofe osikapa' mgbe ahụ. E ji ụfọdụ akwụkwọ mere ọgwụ: A na-eji akwụkwọ mkpụrụosisi ọkwụrụarọ (pawpaw), akwụkwọ mangoro na akwụkwọ lemọọnụ eme ọgwụ e ji agwọ ịba. A na-esi ya esi, ṅụọ ya aṅụọ ma jirikwa ya saa ahụ. Etu esi ahazi Ji Kpacha 6)Osikapa: Mgbe gboo ọkachasị mgbe agha, a na-enwe ụdịrị osikapa dị iche iche nke gụnyekwara nke Abakaliki. E nwere osikapa ụzọ ụlọ mana makana e nweghi etu e si ticha ya oge ahụ, a na-esi ya etu ahụ kama ọ ga-eji nji ma e sichaa ya. Ugbua a na-esi osikapa n'ụzọ dị iche iche gụnyere 'jọlọf', nke e ghere eghe, nke mmanụ nri, nke stu, nke ofeakwu, ụfọdụ na-ejikwa ofe dịka ofe egwusi eri ya. Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru 7) Anụ: Oge agha a na-eji ụfọdụ anụmanụ gụnyere agwọ, ngwere, oke (ma nke ụlọ ma nke ọhịa), wdgz eme anụ. Ụfọdụ ndị ka na-eri ugbua, mana ụfọdụ na-asọkwa ha nsọ. A na-agwọ anụ agwọ, eghe ya eghe, ahụ ya n'ọkụ amịkpọ ya amịkpọ ma mgbe ahụ ma ugbua. 8) Ọka: Ị jụọ onye ọbụla hụrụ agha Biafra, otu ihe ha ga-akpọ aha bụ 'corn meal', bụ ihe a na-eke ha oge ahụ. Ọ bụ ihe e si n'ọka mepụta. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a maka ụgba agwọrọ agwọ ga-amasị gị: Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?" afirika-46364585,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46364585,"Premature Ovarian Failure: Ahụghị m nso m, chee na m dị ime",E nyopụtara na Evans nwere nsogbu ihe nsọ ya ịkwụsị n'ike ka ọ gbara afọ 30.,"Nicole, onye dị afọ iri anọ ugbua na-eche maka etu ihe nsọ ya siri kwụsị n'ike O dere BBC 100 Women maka amụtaghị nwa na etu o siri nabata nchọpụta kwuru na ihe nso ya alaala. ""Obara na-apụta n'oge m nọ na nsọ bịara na-agbada, mana oge m gwara ndị ọrụ ahụike n'ala m bụ New Zealand, a sị m na ọ bụ ọgwụ m na-aṅụ butere ya. ""Mgbe otu ọnwa gara, ahụghị ya ma ọlị. M were ọṅụ gaa hụ dọkịta, chee na ọ bụ ime ka m dị. ""Alụọla m di otu afọ dịka anyị bidorola kwuwe okwu ịmụta nwa. ""Mana nyocha m mere gosiri na m adighị ime ọbụla. ""Dọkịta mere m nyocha ọbara wee sị na mmiri ahụ adịghị etu o kwesịrị. O zigara m n'aka dọkịta bụ ọkachamara n'ihe gbasara mmiri ahụ, onye kwuru na m nwere nsogbu ihe nsọ ịkwụsị n'ike. ""Amaghị m na akpa akwa mmadụ nwere ike ịkwụsị oge mmadụ abụbeghị okenye. Ọ bụ ihe tụrụ m oke anya. "" Oge ugbua, ndị na-akwado na nwaanyị nwere ikike ịdị ka nwoke na-ekwu na nwaanyị nwereike ime ihe masịrị ya mgbe ọ masịrị ya. Mana nke a bụ nnukwu asị na-eri ụmụnwaanyị ihe dachiri atụmatụ anyị inwere onwe anyị. Nicole, ụbọchị ya na di ya gbara akwụkwọ Ekwenyere m na ndị na-ewu ewu na-ebute etu ndị mmadụ si eche maka amụghị nwa; ebe a na-egosi na nwaanyị nwere ike ịmụli nwa rue ka ọ gbachara afọ 50. Nke a na-eme ndị mmadụ eleghara njirimara nsogbu amụtaghị nwa anya na-amaghị ama. ""Amaghị m na ime isi ike nwere ike ibido na nwaanyị oge o ruru afọ iri atọ na ise. ""Anyị kpebiri ime IVF site n'enyemaka otu ezi enyi. Enwere m olileanya na nke a ga-aza ekpere anyị mana ọ bụrụ sọọsọ otu akwa dị mma. ""Emechara, adịghị m ime. Owutere anyị niile. ""Ka otu afọ gachara, otu onye kwetere ka o nyere anyị aka, obi akaghị anyị. Nke a bụ nleta ikpeazu gọọmentị na-enyere anyị aka ịkwụ ụgwọ ya. Anyị mere ya n'ihi na eruola m afọ iri atọ na abụọ. Oge na-aga."" Gịnị bụ menopọsụ? Ebe e siri nweta nke a: NHS UK Ọ dị mwute na akwa abụọ etinyere n'afọ oge mere IVF emeghị ọfụma nke anyị na-enwe ego maọbụ mụọ ime IVF nke atọ ya. Enweghị mụọ ikute nwa. Dịka a rụkachara m ahụ, ị mara na m ga-ebido njem ndu ọhụụ, ọrụ ọhụ, okwu ego na ihe ndị ọzọ a na-enyocha tupu ekunye mmadụ nwa. N'ezie, ama m ihe o jiri dị mkpa, n'ezie, aghọtara mkpa ọdị, mana enwelighị m ike ya n'ihi ihe m gabigacharala. Mụọ mụ kpụrụ n'ala. Obi mgbawa na ụmụ mmadụ kara ịmụ efuola ji m nke na onyeghị etu m ga-esi kọwaa ya. Obi mwute di gidere were rue otu mgbede. Enyi m nwaanyị na nwa ọhụrụ ya bịara, o rue ka ha lara, m chọpụta na agụ ịmụta nwa nke m alala. Ọ lara fịam! Enweghị m ike ịkọwa ya karia na Chineke wepụrụ ya n'ime obi m. M leghachi anya azụ ugbua, amara m na onwere m ebunobi ka mma - ezi mmekọrịta mụ na ya. Ọtụtụ ndị dọkịta amaghị maka nso nwaanyị ịkwụsị n'ike. M na ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'otu nkwado m bidoro akparịtala ụka, ha were kwuo na ha gwa dọkịta ha na ihe nso ha anaghị apụtazi dịka o kwesiri ,na ha na egbu oge tupu ha zigara ha dọkịta ọkachara mara n'ihe gbasara nsogbu ahụ. Kemgbe e nyochapụtara nsogbu a, ana m aṅụ ọgwụ maka mmiri ahụ nke Bekee kpọrọ ""Hormonal Replacement Therapy"". Ekelere m chukwu maka nleta a, n'ihi na dịka m kụrụla afọ 40 ugbua, ọ na-ara m ahụ ịkpa nkata maka ihe gbasara isi ịghasa mmadụ, ahụ ekpomọkụ, na ihe ndị ọzọ so ihe nsọ nwaanyị ịkwụsị n'ike. Ọ na-eme m ihere nke ukwuu ịkọwa onwe m nye onye ọbụla. Ọ bụ ihe ọma ịgbalahụ mmefu ego dị n'ịzụ akwụkwọ nwaanyị ji ahụ nso ya kwa ọnwa. Mana o were m oge tupu m huwa uru dị n'ọghọm ahụ. Gini bụ'BBC 100 Women'? BBC 100 Women na-akpọpụta ụmụnwaanyị 100 kajara akaja nakwa ndị na akpalite mụọ mmadụ n'ụwa niile kwa akpọ ma kekọrịta akụkọ ha. Nke a bụ afọ pụụ iche maka okwu gbasara ikke dịrị ụmụnwaanyị n'ụwa niile. Ya mere,n'afọ 2018 BBC 100 Women ga-elebanye anya n'ụmụnwaanyị ndị ji obi ọkụ ha, iwe ha were na-eweta ezi mgbanwe n'ụwa ebe ha nọ. Chọta anyị na Facebook, Instagram na Twitter ma jirie #100Women" afirika-50266107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50266107,Anambra Fire: Gọọmentị amachiela gwongworo bu mmanụ ụgbọala ịgba n'ehihe,Gọọmentị Anambra sị na ọ chọghịzi ka gwongworo bu mmanụ ụgbọala ịgba n'ehihe na steeti ahụ.,"Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba bụ onye binyere aka n'akwụkwọ mgbasaozi kwọwara etu atumatụ a ga-esi gaa. Adinuba sị na atụmatụ a ga-emetụta gwongworo ọbụla bu mmanụ ụgbọala pụtara maka mberede ọkụ dakwasịrị steeti ahụ n'ime ọnwa Ọktoba nakwa gwongworo dara n'ụtụtụ ụnyaahụ. Akwụkwọ a sị site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba bụ Satọde, agaghị ekwe ka gwongworo bu mmanụ ụgbọala banye ụzọ site elekere ise nke ụtụtụ ruo elekere asatọ nke abalị. Ọzọ bụ na ụgbọala ndị a agaghị agbafee ọsọ ihe Bekee kpọrọ ""90km per hour"". Gọọmentị Anambra sị ka ndị ọrụ nchekwa hazie onwe ha maka ọrụ dịrị ha banyere atụmatụ a. Akwụkwọ a gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị Anamabra ga-ata onye ọbụla dara iwu a ahụhụ ruru ihe ha mere. Ọ rịọrọ ndị na-ebugharị mmanụ ụgbọala ka ha diwe nsogbu ọbụla atumatụ a ga-ebute ma nyere gọọmentị aka hụ na atumatu a e mere maka nchekwa obodo di ire. Cheta na ọkụ ọgbụgba sitere na gwongworo dara n'ụzọ si Onịcha gawa Enuwgu banyere ọwammiri wee tapịa ngwaahịa na mmadụ n'ahịa Ọchanja n'ụbọchị nke iri na isi nke ọnwa Ọktoba, 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43283948,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43283948,Timothy nwa George Weah ebidola ịsompi na PSG,"Nwa onyeisiala Liberia bụ George Weah a na-akpọ Timothy Weah ebidola ịgba bọọlụ n'otu egwuruegwu PSG, ebe nna ya gbaburu bọọlụ na mbụ.","Timothy Weah ọ ga-emenwu ọfụma ka nna ya dịka ndị mmadụ si eche? Timothy pụtara n'ọgbọ ụnyahụ ka PSG na Troyes sọọrọ mpi. Ka Neymar na Kylian Mbappe anọghị n'ọgbọ maka ahụ ha merụrụ, Angel di Maria na Christopher Nkunku bụ ndị nyere goolu PSG ji nwete mmeri n'asọmpi a. Neymar na Mbappe n'anọghị ya so nye Weah ohere ịgba n'asọmpi a. George Weah nyere goolu 55 oge ọgbara bọọlụ na PSG Nna Timothy bụ George Weah gbaara ndị PSG bọọlụ tupu n'afọ 23 gara aga, tupu ọ gawa AC Milan. PSG nwere asọmpi 10 n'ihu, n'ime nke ha kwesịrị inweta ọnụọgụgụ 17 ma ọ bụrụ na ha ga-ebuli iko 'French League' nke afọ a. Ha na Real Madrid ga-ezukọ na Tusde ịgba agba Champions League nke abụọ ha. N'agba nke mbụ, Real Madrid ji 3-1 merie ha. Onye egwu ha bụ Neymar agaghị asọmpi ọzọ n'ime 'season' a maka ahụ ọ merụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44277377,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44277377,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Moses apụọla n'otu ga-aga Russia,Akụkọ kachasị mkpa: Ndị IPOB na ndị uweoji na-ama aka n'Anambra steeti.,"Nke abụ maka iwu ndị IPOB nyere sị ndị mmadụ ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa mee. Ndị uweojii jisike na-ekwu na ha enweghi ịke ị nye ụdị iwu ahụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa Minister na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na Buhari mezuru nkwa niile o kwere ndị Naịijirịa. Ọ sị na Buhari doziri ihe ndị gbasara nchekwa, akụ na ụba obodo na npụ karịcha. Na mba Ofesi Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị na Italy akpọla oku ka achụtuo onyeisiala ha bụ Sergio Mattarella n'ọkwa ọchịchị Luigi Di Maio kwuru nke a mgbe onyeisiala ha jụrụ ị nabata aha Guiseppe Conte dịka minista ga-eso n'ọchịchị ya Cheta na amabeghị onye meriri ntuliaka Italy mere kemgbe ọnwa Maachị. N'egwuregwu Moses apụọla na otu 'Super Eagles' ga-aga asọmpị iko mba ụwa. Moses Simon bụ onye egwu boolu 'Super eagles' agaghị aga Russia n'ihi na ọ merụrụ ahụ na akpata ụkwụ. Nke a pụtara na ọ fọrọ mmadu iri abụọ na itoolu ga-agazi asọmpịi ahụ. Gee akụkọ ndị mere taa n'ime otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-43586565,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43586565,Ụlọọrụ ntaakụkọ Uganda:Kọọ maka mwakpo emere gị ma nweta karama mmanya,Ndị ntaakụkọ Daily Monitor dị na Uganda akpasuola ndị mmadụ iwe na soshal midịa maka ihe ha dere gbasara ụmụnwaanyị a wakporo n'ike.,"Ndị Daily Monitor arịọla ndị mmadụ mgbaghara maka ihe ha dere N'ihe ha dere, ha kwuru sị na nwaanyị ọbụla a wakporo n'ike ga-ezitera ha akụkọ ihe ọ gabigara, ga-enwe ohere ịnweta otu ""karama mmanya dị oke ọnụahịa"". Dịka ihe gọọmentị ndị Uganda depụtara n'afọ garaaga, a wakpooloa ihe karịrị otu n'ime ụmụnwaanyị ise ruru afọ 15 ruo 49. Mana Daily Monitor kwuru na akụkọ ọzọ e depụtara gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị a wakporo karịrị etu ahụ. Dịka ha siri kwuo, o ruru pasentị 51 bụ ndị ga-enweta mmekpa ahụ n'aka ụmụnwoke ha na ha nwere mmekọ n'ime ndụ ha. End of Twitter post, 1 Na mbido ọnwa Maachị a, ndị mmadụ tara otu onye omeiwu Uganda ezigbo ụta maka ihe o kwuru n'onyonyo sị ""dịka nwoke ị bụ, ị kwesịrị ị na-eti nwunye gị ihe. ""Ị kwesịrị ịmetụ ya nwaobere aka, tie ya ihe iji hazigharịa omume ya."" Akụkọ ga-amasị gị Kemgbe ndị mmadụ ji tinye ọnụ n'okwu a, ndị Daily Monitor arịọla mgbaghara maka 'nghọtaghie ọbụla' ihe ha dere buterela ndị mmadụ. Ha ehichapụkwala ihe ha dere n'igwe okwu, mana ọ kwụsịghị ụfọdụ ndị mmadụ ikwuputa iwe ha." egwuregwu-43276118,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43276118,Deontay Wilder kwuru na ọ na-echebiri Anthony Joshua,Nwaafọ mba Amerịka bụ Deontay Wilder na-akọwa na ya dị nkwadobe ka ya na Anthony Joshua pịa ọkpọ.,"Deontay Wilder chọrọ ka ikike egwuruegwu ọkpọ niil ruo ya aka Wilder kwuru nke a dịka o meriri Luis Ortiz ma nweta ihe nrite WBC ya. Wilder, dị afọ 32, pịaturu Ortiz, bu nwaafọ Cuba, ugboro abụọ tupu ọ pịa ya nke akpọrọ 'knockout' n'asụsụ Bekee n'agba iri n'ime asompi ha mere na New York. Joshua bụ onye ji ekike nke IBF na WBA ga-ezute Joseph Parker nke New Zealand na Cardiff nke dị na mba Britian n'ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị. ""Achọrọm ịchịkọ ikike a niile. A dị m njikere mgbe ọ bụla ha dị na njikere."" Wilder kwuru. Ọkpọ nke Ortiz pịara Wilder na agba nke asaa bara ya na-ahụ, mana ọ chịkọtara onwe ya, wee nweta mmeri nke 40 ya kamgbe o bidoro pịawa ọkpọ. ""A chọtara m ụzọ m siri laghachite. Onye mmeri ga-achọtarịrị ụzọ. Ihe a ka m mere na abalị a,"" Wilder kwuru. Ortiz nwere mmeri n'ọkpọ 28 nke ọ pịarala tupu ya na-ezute Wilder. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48300693,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48300693,Manchester City vs Watford: Man City eliela Watford na ndụ mee akwa ha,Watford agbaghị akahịa taa na Wembley mgbe Manchester City ji ọkpụ goolu isii chara acha nyụọ ha ịkpakwụ.,"Ya bụ goolu malitere ịbata na nkeji iri abụọ na isii mgbe David Silva ji goolu mbụ gbaa akaahịa. Ka a na-eme nke a, Raheem sterling zara aha ya na nkeji iri atọ na asatọ site n'imezu ya abụọ. Ndị Manchester nyopuru na egwu ji Watford werezie goolu sawa ha ahụ. Onye ọbụla malitere ịza ""present"" na ọnụ goolu ndị Watford. Kevin Brunye mezuru ya atọ sịzịa Gabriel Jesus ya bịa gozie ha na nkeji iri isii na asatọ. Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Sterling mezuo nke ya atọ bụ nke mere ya ọkpụ isii. Ka nke a na-eme, Wafford gosiri ike ha site n'ikpoko ""yellow card"" abụọ, ebe ndị Man. City ji otu. Nke a mere ka asọmpị a bia na ngwucha mgbe Manchester City ji ọkpụ isii merie Watford were maburu iko FA afọ 2019. Ihe a bu Iko nke ato Man City na-amabute n'afo a. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri a Igbo Origin: Aguleri na Nri na-azọ ndị bụ isi Igbo - Nke Ikpeazụ" afirika-50066185,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50066185,Ndị uweojii Bulgarịa anwụchiela mmadụ isii na-akwado ịkpa oke agbụrụ,Ndi uweojii mba Bụlgarịa anwụchiela mmadu isii bụ ndi nkwado otu egwu bọọlu Bulgaria maka ikpa oke agbụrụ.,"Ndị nkwado otu bọọlụ Bụlgarịa anwụchịri maka ikpa oke agbụrụ Ndị otu bọọlụ Ingland kwụsirị igbe asọmpi maka oke agbụrụ Agwa ọjọ a mere n'asọmpi ntozu Europa ebe ndi Briten ji ọkpụ goolu isii asataghi ma ncha were merie ndị nke Bulgaria. N'Ọnịcha Tanka bu mmanụ ụgbọala awụfuola ma nwuru ọkụ nke bidoro gbawa kamgbe elekere iri na abụo nke oke ụtutụ taa n'Ọnicha. Okụ a gbara ihe ruru awa iri maọbụ karịa Ọkụ a bidoro na 'Upper Iweka' were ruo Ọchanja nke di n'Ọnịcha. Tanka agbara ọkụ n'Ọnịcha Ndị uweojii kwuru na ha amabeghi mmadụ ole ọkụ a rere, mana ha ebusoola ọkụ a ọgụ n'iji menyụọ ya mana ọ ka pere mpe fọrọ. Aga-ebido nnyochaa ụgwọ ọnwandị ọrụ gọọmentị gbalitere 'A ga-enyocha ụgwọ ndị omeiwu na ndi Gọvanọ' - Chris Ngige Gọọmentị Naijiria enyela ikike ka ngalaba na-ahu maka ikwụ ụgwọ bụ 'Revenue Mobilization Commission' ka ha nyochaa ụgwọ a na-akwụ ndi gbalitere n'ọrụ gọọmentị nke gụnyere ndị Gọvanọ na ndị omeiwu. Ọ bụ minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige kwụru na atụmatu a bụ ụzọ a ga-esi wetuta mmefu gọọmenti na-emefụ kwa afọ. N'Ofesi - Brexit Bọri Johnson na-acho nkwado ndi omeiwu na Ingland Ndị nnọchiteanya Iropịan Ụnion na ndị nke mba Briten ebidola mkparịta ụka maka ọpụpụ Briten na Iropịan Unịon ọzọ. Dịka Briten hiwere ụbochị iri ato na otu nke ọktoba dịka ụbọchi ọpụpụ ha na Iropịan Union, Onyeisiala ha bụ Boris Johnson kwuola na ha ga-apụ 'ụbochi ahụ na-agbanyeghị. Akụko ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Mama Jessie Onuigwe: Mama dị afọ 104 ji ọrụ ugbo zụọ ụmụ ya Otu ndị ahịa a kpọrọ South-East Amalgamated Market Traders Association (SEAMATA) arịọla onyeisiala Buhari ka o mepeturu ha ụzọ maka ibupu ngwaahịa ndị ziri ezi. Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha degara onyeisiala Buharị ụnyaahụ bụ nke onyeisi ha bụ Gozie Akudolu na odeakwụkwọ ha bụ Alex Okwudili tinyere aka na ya. Ha kwuru na ọnụ ego ngwaahịa ndị emepụtara na Naịjirịa arịala ezigbo elu karịa aka ndị mmadụ. O kwuru na nke a nwereike ime ka ụlọọrụ ha dị iche iche chụọ ndị na-arụrụ ha ọrụ. Ha rịọrọ onyeisiala ka o biko lebanye anya etu a mmechi okeala ndị a ga-esi metụta ezinaụlọ ndị mmadụ na Naịjirịa. Karịsịa ndị na onweghi ka ọ dị bụrụ ha n'ụzọ inwete nri nakwa ihe eji ebi ndụ. Abụbụ ọrụ agaghịzị amalite taa Nke bụ eziokwu bụ taa bụ na otu jikọtara ndị ọrụ oyibo sị na ha agakwaghị agba abụbụ ọrụ ha chọbụrụ ịmalịte taa. Otu a sị na mkparịtaụka ha na gọọmentị ga-aga n'ihu taa maka ụgwọ opekatampe iji kapịa okwu a ọnụ. Erdogan e cheleara Amerịka aka mgba N'ofesi, Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan akpọọla ekwo nkụ na ya ga ebuso Syria agha agbanyeghị aka na ntị mba Amerika dọrọ ha. Cheta na Amerịka kwakọọrọ ndịagha ha pụọ n'okeala ahụ bụ ebe ndị Kurd na Syria na agwọkọrịta onwe ha ji mmanụ kemgbe. Mmeru ahụ David de Gea bụ ọghọm dịịrị Manchester United Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45352939,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45352939,Saraki: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya ịzọ ọkwa onyeisiala.,Onye ọkammụta n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchichị bụ Samuel Olisa kwuru na mkpebi Saraki ịzọ oche onyeisiala diri ọchịchị onyekwuoucheya na Naịjirịa mma.,"Bukola Saraki si na Pati APC banye na PDP na nsonso a Mana Olisa kwuru na Saraki agaghị emeri na ntuliaka imeụlọ maka na Kwankwaso bụ aka chiburu Kano steeti ka ewu ewu n'Ugwu Awụsa. Olisa kwukwara na o cheghị na Saraki ga-agba arụkwaghịm ugbua o kwuputara ebumnuche ya gbasara ịzọ ọkwa onyeisiala. Iji maa atụ, o kwuru na onyeisiala aetinyeghị akwụkwọ arụkwaghị oge o kwupụtara na ya ga-azọ ọkwa onyeisala ọzọ. Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu niile Saraki ga-emeri na nsogbu niile ọ na-agabịga ugbua dika onyeisi ụlọomeiwu. Cheta na Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwupụtere taa na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala na 2019. O kwupụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ya na ndị ntorobia chọrọ ịzọ ọchịchị nwere taa bụ Tọọsde. Saraki tụrụ arịrị na oke agụ, ọnọdụ akụnaụba Naijiria nke kprula afọ n'ala nakwa nsogbu nchekwa bụcha nsogbuchere Naijiria aka mgba, sị na ọ bụ ihe ndị a ka ọ lechara anya were sị ka ọ za oku ndị na-eto eto na akpọ ya ịzọ ọkwa onyeisiala. "" Ọ bụ n'ihi ihe ndị a ka m jiri na-ekwupụta ebumnobi m ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka na-abịa na 2019 n'otu parti PDP."" Ihe ndi mmadu na-ekwu na Soshal midia maka mkpebi a: @babaidris090 kwuru na ọ nabatara mkpebi Saraki dika iheoma. @adeoludada2003 kwuru na Saraki azọpụtaghịnwụ ndị Kwara steeti ma ya fọrọ ịzọpụta ụmụ Naịjirịa. @seguntomori nabatara ya bụ mkpebi mana na-ayọ Saraki ka o lebanya na ahụhụ ndị odibo omeiwu na-ata. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48852850,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48852850,Women in marriage: Ihe mere ụmụnwaanyị ji akwado di ha ma e bo ha ebubo,"Dị ka ndị Bekee si ekwu "" nwoke na-eme nkeọma nwere nwanyi na-akwado ya ""","Ma ọ dị mma ma ọ di njọ Mana n'aka nke ọzọ, nwoke na-eme ihe dị njọ ma ọ bụ eboro ebubo dị njọ, umunwaanyị ha na-akwadokwa ha. Nwunye na-akwado Di ya Ị ga-ahụta atụmaatụ gbasara nkea dịka mgbe eboro pastor Suleman ebubo ma nke mere nsonso a dịka ọ na-akpọtụ na COZA maka Pastor Biodun Fatoyinbo Nkea gbara ụfọdụ mmadụ gharii nke mere ka BBC zọpụ njem imata ihe kpatara nkea. Anyi jụrụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara ezinụlọ ka ha kọwara anyị nkea. Guo ihe ha nwere ikwu : Oriaku Ifeoma Nnadozie -"" Umunwanyi dị ka ulọ, ha na ekpuchite ọtutu ihe."" Nnadozie kwuru na dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo, umunwaanyi dị ka ụlọ maka na ha nwere ndidi, ma nwee olileanya na otu ọbụla ọdị na ọ ga adị nma. Umunwanyị na-anyịdo ihe, ya mere eji kpọo ha 'Nwa-anyị' maka na ha na-edi ihe. Kama, nwaanyị na-ekpuchi dị ya ebe ọ na-eme ihe dị njọ ga-enwe ntaramahụhụ. Chidi Lemchị -"" Ihe gbasara alụm dina nwaanyị bụ ma ọ dị nma ma ọ dị njọ."" ""Alụm di na nwaanyị bụ ma ọ dị nma ma ọ dị njọ, a ga m akwado gi."" Nwaanyị anaghị akwado ihe ọjọọ ma ọ bụ ebubo ọjọọ eboro dị ya kama ọ na-akwado onye ọ lụrụ. Mgbe nwaanyị kwadoro di ya ma soro ya eme mpụ, nkea abughịzị alum di na nwaanyi, nke ahụ bụ zi azumahịa. Akụko ga-amasi gị Lee ihe nkiri a : Omega Power Ministry: 'Ndị ọzụzụ atụrụ ekwesịghị iri atụrụ etinyere ha n'aka' - Apostle Chinyere" afirika-50078876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078876,Enugu Airport Closure: Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari,Amapụtala ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari,"Akụkọ dị mkpa Onyeisiala Muhammadu ekwuola na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. O kwuru na o mere nke na-agbanyeghi ụkọ ego dị n'iji arụpụtala ihe dị iche iche chere gọọmentị n'ihu. Onyeisiala Buhari sị na dịka ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị ya ịrụ akụrụngwa dị n'obodo na ọ bụ nke a. O kwuru na minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekweela ya ngwa na a ga-arụcha ọdọụgbọelua n'oge na-adịghị anya. Cheta na o ruola ihe dịka izuụka itoolu gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ma kwuo na a chọrọ ịrụzi ya. A ga-ebelata ego ndị ụlọọrụ gọọmentị ji eme njem Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ebelata ego ndị ọrụ gọomentị gbalitere n'ọkwa. Site ụgbụa gawa n'ihu, 1) Nanị ụbọchị onye ọrụ a kwesịri i nọ maka nzụklo ọbụla ka gọọmenti ga akwụ ụgwọ ya. 2) Onye ọbụla na-aga nkem ga egosi akwụkwo na-egosi ihe kpatara o ji eme njem. 3) Ọ bụ nanị njem gbasara gọomenti ka a ga agwụ ụgwọ ya. 4) Mmadụ anọ nani ga eso ndị minista eme njem nke ga agunye 'Director', 'Schedule Officer' na onye enyemaka Minista. Ndị minista ka n'ọkwa bụ mmadu atọ. 5) Onyeisiala kwuru na ọ bụ nani ụgboro asatọ ka gọomentị ga-akwụ ụgwọ njem n'afo. kama,ndị minista, 'Permanent Secretary', onyeisioche ndị 'Extra-Minsterial Departments', 'Chief executive officers' na ndị 'Director'. Ndịagha Naịjirịa esila n'ịgba Egwueke banye Atilogwọ Udo Ndịagha Naịjirịa sị na emume 'EGWUEKE' ha na-eme n'ọwụwanywnụ Naịjirịa ga na-aza zi 'ATỊLỌGWEỤ UDO'. Ozi a dị n'akwụkwọ ozi si n'akara Twitter ha bụ nke onye nghazi mgbasaozi ha bụ Aminu Iliyasu tinyere aka na ya. Ndị agha Naịjirịa were nwayọ na-akpasu ndị otu IPOB Emume a dịka ha si kwuo bụ nke ha na-eji azụ ndịagha n'ụzọ dị iche iche malitere n'afọ 2016. Ndịagha sị ha na-ejikwa emume a ememina mpụ ndị dịka ohi, ntọrị mmadụ, agha ndị otu nzuzo, esemokwu dị n'etiti obodo nakwa ndị ọzọ. Ha kwukwara na mgbanwe aha emume apụtaghị na usoro e ji eme ya agbanwela, na usoro niile ha ji eme ya ka kwụ etu ọ dị na mmalite. Cheta na ọ bụ n'oge emume 'EGWUEKE' nke afọ 2017 ka ndịagha wakporo ụlọ onyendu Ipob bụ Nnamdị Kanu dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steeti. Boris Johnson sị na Briten na UK enweela nkwekọrịta Otu 'European Union' na mba Briten enweela nkwekọrịta maka etu Briten ga-esi hapu EU dịka Praịm Mịnịsta Briten bụ Boris Johnson sị kwuo. Ha nwere mkparịtaụka a n'Obodo Brussels nke dị na mba Belgium. Johnson kwuru na ""anyị enwetela ezigbo nkwekọrịta ga-enye anyị nnwereonwe"". Ọ teela ndị isi mba abụọ a ji enwe mkparịtaụka maka ọdịmma onwe ha ma ọ bụru na Briten hapụ EU, mana nkwekọrịta a ha nwere ka ga-aga n'ihu ndị omeiwu mba Briten nakwa nke ndị EU iji binye ya aka. Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Democratic Unionist Party' (DUP) ka na-ekwusi ike na ha akwadoghi nkwekọrịta a. Ndị pati a bụ nke ndị Northern Irish ekwubụọla na ha agaghị atụkwasi obi n'okwu Johnson. Onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Jeremy Corbyn boro aka n'isi tie mkpu sị na mkpebi a Johnson na aṅụrịrị kakwa njọ karịa nke Theresa May nwetere. Corbyn kpọkuru ndị otu ya ka ha ghara ịge Johnson nti n'ihi na okwu ya bụ okwu onye awụrụaka. N'aka ọzọ onyeisi European Commission bụ Jean-Claude Juncker sị na ya bụ mkpebi dị mma n'ụzọ ga-abara mba abụọ ahụ uru. Aisha Buhari na ndị enyemaka ọhụrụ Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ị nụrụ na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị enweela ndị enyemaka mmadụ isii ọhụrụ. A nụrụ na ndị a gụnyere Mairo Almakura, Muhammed Albishir na Wole Aboderin. Ndị ọzọ bụ Aiyu Abdullahi, Zainab Kazeem na Funke Adesiyan. Aisha ji ohere a arịọ mgbaghara maka ya bụ ihe onyonyo pụtara na sochịal midia ebe ọ na-abamba. Trump ekweghị ojiji Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Akọgbuola onyeisiala Trump n'ọnụ maka mkpọpụ ọ kpọpụrụ ndịagha Amerịka na Syria. Trump n'onwe ya achọkwaranụ ịma, ebe ọ na-ekwu na Amerịka abụghị ndị uweojii mbaụwa. A na-eche na ọ bụ maka ọpụpụ a Amerika pụrụ mere ndị Turkey ji malite ibuso ndị Kurd agha ọzọ. Egwu a chaala Pogba Paul Pogba a gbaala ise n'ime asọmpi asato Manchester United gbara n'ọgbọ a Kedu ka ị sị hụ ọnọdọ Manchester United n'Asọmpi ha na Liverpool na-aga ịgba? Onwebeghi onye ma ebe ha bụ asụrụ asụ dewere ọdụ ebe a sị na Paul Pogba agaghị esokwa gba ya bụ bọọlụ. Anyị nụrụ na Pogba merụrụ ahụ dịka ojisiaghọ mgbo ha bụ de Gea. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Mama Jessie Onuigwe: Mama dị afọ 104 ji ọrụ ugbo zụọ ụmụ ya Akụkọ ga-amasị gị taa" afirika-47844012,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844012,Nwaanyị a gbara di ya ọkụ makana ọ na emegbu ya,"Otu mgbede, otu nwoke aha ya bụ Deepak Ahluwalia ji igwe eji ede akwa ọkụ hie nwunnye ya bụ Kiranjit n'ihu nke nyere ya apa.","Nwaanyị a nwetere ezogbote ụhụ maka ihe a di ya mere ya nke naghara ya ụra. Omeela afọ iri atọ ihe a mere, ọ gwara BBC na ọ bụ ihe mere ya jiri kpawa nkata etu ya ga-eji memina di ya ka ọtakwanụ ụdịrị ahụhụ ya na-ata. N'ime ofu abalị ahụ di ya tere ya igwe akwa ahụ, ọ wụru ya mmanụ ọkụ n'aba ka ọ na ararụ ụra wee mụnye ya ọkụ. Ka o mechara nke a, o kuru nwa ya gbapụ ọsọ. ""Eche m na ọ bụ sọ ụkwụ ya ga-agba ọkụ ka ọgharị ịchụ m. A ga m enye ya apa nke ga-eme mgbe ọ bụla ọ hụrụ m, o chete m."" Ọ si na ya atala ezigbo ahụhụ na mmegbu n'aka di ya ruo afọ iri. Ọ sị na o bidoro n'ụbọchị ọ lụrụ ya. Kiranjit siri ọnwụ na ya achọghị igbu di ya. Kiranjit Ahluwalia (Onye nke abuo site n'aka ekpe) mgbe atọghapụrụ ya Mana ka ubọchị iri gachara, ọnya dị Deepak n'ahụ gburu ya. A tụrụ Kiranjit nga n'ọnwa Decemba nke afọ ahụ. Mkpebi ụlọ ikpe bụ na ọ ga-anọ na nkpọrọ nwụọ maka ọnwụ di ya. Mana ka otu ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye bidoro mebe mkpọtụ maka okwu ya, ekpegharịrị ya, nke mere eji nye ha afọ atọ na ọnwa anọ n'ụlọ mkpọrọ. Oge bụ oge ọ nọ na mkpọrọ mgbe ahụ, nke mere eji hapụ ha ka ọlaba. Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?" afirika-45769608,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45769608,PDP Convention: Ihe Atiku Abubakar kwuru maka mmeri ya,Atiku Abubakar ekwuola na ya anabatala ọnụ ọgụ vootu pụtara na Portharcourt taa ebe o meri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'okpuru patị PDP.,"Atiku Abubakar chiburu dịka osote onyeisiala Naịjirịa N'ime ozi nnabata ya, o kelekwara ndị ọzọ sọ n'ịzọ yabụ ọkwa na ntuliaka imeụlọ ahụ. Naịjirịa ahụọla ọrụ aka APC Atiku kwukwara na o nwere olilianya na Naijiria ga-anabata otu ndọrọndọrọ PDP mgbe ha ga-ebido ntuliaka 2019 makana ha hụọla ọrụ aka APC. N'ọnụ okwu ya: ""Patị anyị ga-akagbu aha ala anyị Naịjiria n'ime aha ndị mba ogbenye na mbaụwa, ala anyị ga-alaghachị azụ n'ala ọma ọ bụrụ n'oge garaaga"". Sinatị President Bukola Saraki kelere Atiku Abubakar maka mmeri o nwetara na ntuliaka PDP chịkọbara n'Adokie Amasiemaka stadium. Saraki kwere nkwa na ya na ndị dara ada ibe ya ga adọnyere Atiku ukwu ka ha napụta Buhari na APC ọchịchị. Atiku Abubakar onye mmeri! A kpọpụtala Atiku Abubakar dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP na ntuliaka Atiku Atiku onye nwetara vootu 1,532 kachasị mmadụ 12 zọrọ ọkwa ahụ. Ndị na-eso ya bụ Aminu Tambuwal onye nwetara 693 na Bukola Saraki onye nwetara 317. N'ime ozi o dere na twitter, o kele ndị otu PDP niile maka mmeri a. Atiku na Buhari ga-ama mbe abụọ nke bụ oke na ntuliaka afọ 2019. Lee ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa ọnyeisiala na ntuliaka ahụ dịka ngụkọ na-aga ugbua: Nhọchasị akwụkwọ vootu A gụwala vootu a tụkọtara taa n'ọgbakọ ugwu PDp na-eme n'Abuja kemgbe ụnyaahụ bụ Satọde. Ịtụ vootu kwụsịrị ka o ji nkeji iri na isi gafee Elekere isii(6.16am) ewere bido ihazi vootu nke onyeisi Kọmịtii ntuliaka ahụ bụ Gọvanọ Ifeanyi Okowa nọ n'isi ya. Iji mee ka ọgbaaghara ghara ịdị Gọvanọ Okowa ekwuola na ha agaghị ekwu okwu n'igwe e ji ekwu okwu ganye na ha agụchaa ya bụ vootu. Ndị nnọchiteanya mmadụ 4000 bụ ndị bịara ya bụ ije mana naanị madụ 3274 bụ ndị nwetara ikike sonye tụọ vootu. Ka ọ dị ugbua, ndị kọmitii na-ahụ maka ntuliaka ka na-ahọchasị akwụkwọ vootu, ebe ọtụtụ ndị nkwado na-agụ egwu na-enwe aṅụrị iji kwadobe maka mmeri onye nke ha. Mbido ịtụ vootụ Ndị nnochiteanya (delegates) bidoro kwụwa n'ahịrị n'ụzọ ụtụtụ taa bụ ụka n'ama egwuregwu Adokiye Amasimaka dị na Pọtakọt. Nke a na-eme dịka mmadụ 12 na-azọ ọchịchị onyeisiala kwuchara ihe ha ga-emere ndị Naịjirịa ma ha nweta ọchịchị. Goodluck Jonathan kwuru na obi jupụtara ya n'aṅụrị n'ihi na PDP adịla njikere iweghara ọchịchị na 2019.Ike Ekweremmadu jikwa ohere ahụ kwuo na ndị niile na-azọ ọchịchị kwere nkwa ịkwado onye ọbụla pati họpụtara. Ufọdụ ọnụọgụgụ ndị nnochiteanya tinyere aka n'akwụkwọ gụnyere; 'PDP adịla njikere ịnarakwa ọchịchị na 2019' Uche Secondus gwara ụmụ Naịjịrịa ka ha napụta Obodo ha n'aka ndị APC Onyeisi otu PDP bụ Uche Secondus ekwuola na pati ha adịla njikere ị napụ Buharị na APC ọchịchị na 2019. Ọ gwara ụmụ Naịjiria ha napụta APC ọchịchị ka o wee diri ha mma. Ebonyi steeti so na ndị denyegoro aha n'akwukwọ na ọgbakọ PDP ma na-eche ka ebido ntụliaka Ka ọ dị ugbua, steeti isii enweteghị ndị ga-ebinyere ha aka n'akwụkwọ na ọgbakọ ukwu PDP. Ndị na-achịkọba ya bụ mbinye aka nke Gọvanọ Delta steetị bụ Ifeanyị Okowa nọ n'isi ya ekwuola na ọ bụ steetị ndị ahụ ka a na-eche ka ya bụ mbinye aka malite n'uju. Steeti ndị ahụ a hụbeghị na ya bụ ogbakọ bụ Imo, FCT, Kano, Kaduna na Yobe. Ndị otu pati na-edebanye aha n'akwụkwọ Anyị ka na-ewetara ụnụ ka o si aga na ntuliaka imeụlọ ndị otu PDP na-eme na Portharcourt ugbua. Ọ bụ ndebanye aha n'akwụkwọ ka a na-eme ugbua nke akpọrọ ""accreditation"" n'olu bekee. Lee foto gosiri ka ime ọgbọ egwuruegwu a dị ugbua: Akpati a ga-eji mee ntụlkiaka. Akpati a ga-eji mee ntụlkiaka. Ifeanyi Okowa bụ onyeisi ọgbakọ na-ahụ maka Convention PDP Onye na-achịkọta Kọmiti na-ahụ maka ọgbakọ a kwuru na ntụliaka ga-amalite na mgbede a Ụmụnwayị Bayelsa eruola ebe ahụ Ka ọ dị ugbua, enyebeghị ndị ntaakụkọ ohere ị bata n'ime ebe a na-eme ya bụ ""Convention"" nke ndị PDP. Mana onye ntakụkọ BBC nọ ebe ahụ ugbua zitere anyị foto ihe na-eme na mpụta ebe ahụ. Ndị na-ere ihe gbasara Pati PDP Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche kwụ chim n'ala nechekwa ebe ahụ. Ndị nso nso ụfọdụ pati PDP Ndị na azọ ọkwa onyeisiala na PDP Onye ka ọ ga-abụ na ndị a? Anya niile na-achakwasị Portharcourt, isi obodo Rivers maka ntuliaka imeụlọ nke PDP (convention) ga-eme na steeti ahụ n'ụbọchị isi (taa) n'ime ọnwa Ọktoba. Ndị na-azọ ọkwa bụ onye chiburu dịka osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar; gọvanọ Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal; gọvanọ Gombe steeti bụ Ibrahim Dankwambo; onyechiburu dịka gọvanọ na Kano steeti bụ, Sinetọ Rabiu Kwankwaso; nakwa onye chiburu dịka gọvanọ gọvanọ Sokoto Steeti bụ Attahiru Bafarawa. Ndị ọzọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ, Sinetọ Bukola Saraki; onye chiburu dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bu David Mark; Tanimu Turaki (SAN); onye chiburu dịka gọvanọ Plateau steeti bụ, Sinetọ Jona Jang; onye chiburu dịka gọvanọ Kaduna Steeti bụ, Sinetọ Ahmed Makarfi; onye chiburu dịka gọvanọ Jigawa Steeti bụ, Alhaji Sule Lamido na Dr. Datti Baba-Ahmed. ''Anyị dị njikere'' Ndị uweojii na steeti ahụ ekwuola na ha ga-enwe ndị uweojii ruru puku iri na abuọ na nari asatọ dịka ndị nche na ntuliaka imeụlọ a. Ha kwuru na ndị uweojii a ga-agba mbọ hu na udo dị n'ọgbọ egwuregwu Adokiye Amiesimaka ebe ha ga-ame ntuliaka imeụlọ a nakwa ebe ndị ọzọ. APC Otu All Progessives Congress ahọpụtala Muhammadu Buhari dịka onye ga-azọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'okpuru APC. Ugbua ka PDP ga-egosi maka ha were udi mmadụ ga-ama Buhari aka mgba nke ukwu na ọsọ ntuliaka 2019. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52798582,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52798582,Jude Okoye: Lee etu ndị mmadụ si dọrie Cynthia Morgan ka Jude Okoye gbachara nkwekọrịta ha n'anwụ,Ndị mmadụ adọrịela Cynthia Morgan dịka Jude Okoye gbara nkwekọrịta ha abụọ nwere n'anwụ.,"Ndị ụlọrụ Northside Inc rụọrọ Cynthia Morgan egwu afọ anọ tupu ha agbasaa N'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ, o gosiri na ihe Okoye kwuru banyere etu ya na Morgan bụ otiegwu nọbu n'okpuru ya si wee gawara onwe ha, na nke Morgan boro ya n'ebubo abụghị otu ihe. Mgbe Morgan pụtara n'izuụka gara aga; kemgbe a na-ahụbeghi ya anya ihe ruru afọ abụọ, o kwuru na Okoye so mee ya ihe mere ya, nke otu n'ime ya bụ ịkwụsị ya iji aha ya agụ egwu. O kwuru na ọ chọrọ ịgbanwe aha ya zawa Madrina, mana Okoye jụrụ ajụ, mere ka nsogbu ya bido. Mana Okoye sara ebubo ahụ ka otiegwu a ma dịka Tunde Ednut gbara ya ajụjụ ọnụ, sị na ""kedụkwanụ etu m ga-esi anapụ mmadụ aha nne na nna ya gụrụ ya?"" Ọ gara n'ihu nye Tunde Ednut akwụkwọ nkwekọrịta ya na Morgan binyere aka. Ka a gbara ya n'anwụ, soshal midia nwurula ọkụ dịka ndị mmadụ malitere itinye ọnụ na ya bụ okwu, na-agwa Morgan na ọ tụgidere Okoye asị. Ụfọdụ kwukwara na o ji asị nakwa obi ebere ha na-emetere ya chọọ ịnapụta ha ego. Lee ihe ụfọdụ kwuru ebe a: Mana ụfọdụ kpụkwa Okoye n'ọnụ, ma kwuo na nkwekọrịta ya na Morgan adịghị mma, na o megidere ya. Mbịaghachite Psquare adịghị m n'aka - Jude Okoye Jude Okoye bụ onye tọrọ Peter na Paul Okoye bụ ndị otiegwu e jibu Psquare mara awụọla miri oyi n'ebumnuche ọtụtụ mmadụ na-akwado otu egwu ahụ site n'ikwu na ya agaghị akpọkọtanwu ha. Jude kwuru okwu a dịka ya na onye otiegwu e ji Tunde Ednut mara, nọ na-enwe mkparịtaụka n'elu Instagram. Ọ sị na ihe mere na ọ gaghị emenwu bụ makana ọ bụ ihe gbasara ya kpatara okwu n'etiti ejima abụọ ahụ. N'okwu ya: ""Paul na Peter anaghị ese okwu. Ọ bụ m ka Peter na-esesa okwu, sị ka m ghara isonye n'ihe ọbụla gbasara egwu ha."" Maazị Okoye gakwara n'ihu kwuo na esemokwu nke kapịrị okwu ọnụ, butere mgbasa ha kpam kpam n'afọ 2017, bụ nke ugboro itoolu Peter gbara abụbụ na ya adịghị emezi. ""Aka m na-ajụkwa nwanne m nwoke ihe na-ese. Ya bịa kwuo ihe m mere ya na-agbawa ya obi ka m rịọ mgbaghara ma gbanwee. Mana kemgbe ihe a mere, o kwubeghi na ọ bụ ihe a ma ọ bụ ihe nke ọzọ."" Onye otiegwu a ma ama bụ Paul Okoye a kọwarala BBC Igbo etu o si agabiga mwakpo n'aka ụmụnwaanyị. Dịka ndị mmadụ sonyere mkparịtaụka Instagram ahụ na-ajụsi ike ma udo a ga-emecha chịa n'etiti ụmụnne atọ a, Jude sị na ọ bụghị ya ka ọ dị n'aka. ""Ọ gaghị emenwu m n'aka. Onye ọzọ nwereike nwaa. Mana ọ gaghị esi m n'aka."" Jude gbara ama na ya nwere mmadụ atọ tọrọ ya, nke mere na ya abụghị diọkpara na be nna ha."" Ọ sịkwa na ndị mmadụ kwesịrị ịjụ ihe mere ụmụnne ha ndị ahụ na ndị nke obere adịghị etinye ọnụ n'okwu a. ""Mụnwa gbara mbọ nke m. Agara m gaa rịọ arịrịọ ma rịọ nwunye onye asị m gaa riọ, mana onweghi nke kwere Peter nnabata."" Jude sị na ya tara ezigbote ahụhụ oge ọ na-arụ ọrụ 'onye nhazi' otu Psquare, mana si na ọ bụ ka ha gawara onwe ha ka ya malitere ""idochi ahụ"". Okwu a niile pụtara makana Jude sị na ya agaghị agbazi nkịtị dịka nwanne ya ji aha ya agagharị. ""Ụmụ m too kedụ ụdịrị ihe ha ga na-anụ na nna ha mere? Ha a ga-ajụ kedụ ihe i kwuru oge ihe dị otu a mere? Ya mere m jiri na-ekwu okwu ugbua. Agaghị m emechizi ọnụ."" Ihe butere okwu Okwu ọhụru malitere dịka otu otiegwu e ji Cynthia Morgan mara kpọrọ Jude Okoye aha dịka onye ji ya n'ụdọ, mere na ọ naghị aganwu n'ihu. Peter Okoye tinyere ọnụ na ya bụ okwu dịka ọ na-ewu, wee kwụnyere nwaada Morgan. Jude kwuru na mkparịtaụka ya na Tunde Ednut na ọ gaara agba nkịtị, mana ọ bụ okwu Peter mere o jiri kwuo okwu. Ọ gara n'ihu gọnarị ebubo nwaada ahụ boro ya, ma kwuo na ha abụọ gawara ụzọ ""onye na way ya"" kemgbe afọ 2017. ""Mmadụ ọ ga-anapụnwu mmadụ aha nne na nna gụrụ ya? Cynthia Morgan bụ aha ya. Onweghi ụlọikpe n'ụwa a ga-anapụnwu mmadụ aha a gụrụ ya."" Ka ọ kwụ ugbua a, okwu nlaghachite Psquare ka dị n'ime ngịga. Paul Okoye nke otu P-Square na-akpọku ndị ntorobịa Naịjirịa" afirika-54299398,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54299398,Chuba Okadigbo: Ihe ise mere Igbo agaghị eji echefu ' Oyi of Oyi',"Taa bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Septemba ka o mere afọ iri na asaa Chuba Okadigbo bụ aha onye ọbụla ma ihe ekwe na-akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijirịa ma nke ọma, jiri laa mụọ.","Dike Igbo a bụ ọkammụta n' okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa site n'afọ 1999 rụo afọ 2000. Ọ bụ mgbe Olusegun Obasanjo nọ n'oche dịka onyeisiala Naijirịa ka Okadigbo banyere n'ọkwa onyeisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu nke Naijirịa. Na-agbanyeghị na ọ nwụrụ mgbe ọ di afọ iri isii na abụọ, ndụ o biri mere na ọtụtụ ndi Naijirịa ọkachasị, nfdị Igbo agaghi echefu ya. Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ e ji echeta ya: 1. Njem ya n'ime Gọọmenti na ndọrọndọrọ ọchịchi Naijirịa E mere Chuba Okadigbo onye ndụmọdụ onyeisiala Naijirịa mgbe Shehu Shagarị bụ onyeisi obodo n'afọ 1979. O soro na otu 'Social Democratic Party' mgbe a chọrọ i nyefe ndị nkịti ọchịchị n'afọ 1993. Okadigbo nọ n'otu 'Peoples Democratic Movement' mgbe Sani Abacha chọrọ inyefe ndị nkịtị ochịchị. Mgbe gọọmentị nke Fourth Repuplic nọ n'ọchịchị ka a hopụtara ya dịka onye omeiwu na-anọchịte mpaghara Anambra North. Ụfọdụ na-atụ anya na ọ bu ya ga-abụ onyeisi ndị omeiwu kama ọ bụ Evans Enwerem ka ndị omeiwu họpụtara dịka onyeisi ha. Kama o rughị otu afọ e wepụ Enwerem dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka. E mechara jiri Okadigbo dochie anya Evans Enwerem. Ndụ ụlọomeiwu mechara wepụ Okadigbo dịka onyeisi ndị ụlọ omeiwu maka ebubo nrụrụaka. Mana Okadigbo bụ a-kwaa-a-kwụrụ, e meechara ọ laghachịrị dịka onye omeiwu na-anọchịte ndị mpaghara Anambra -South n'Ụlọomeiwu Ukwu. N'afọ 2003 ka Okadigbo na Muhammadu Buhari soro zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa dịka osote Buhari n'ọkọlọtọ 'All Nigeria Peoples Party' mana Olusegun Obasanjo na Atiku Abubakar nke 'PDP meriri ha. 2. Mgbe mkpọrọ ọchịchị ụlọomeiwu Naijirịa larụrụ Ogbunike. Otu ihe mere nke ndị mmadụ aghaghị echefu bụ na Chuba Okadigbo dịka onyeisi Ụlọoimeiwu Sineti bu ọfọụlọomeiwu laa n'ụlọ ya n'afọ 2000. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ka Okadigbo nụtara kepukepu na a chọrọ iwepụ ya dịka Onyeisi Sineti, ya emechie ọgbakọ ha nwa oge, buru ọfọ ụlọmeiwu nke Bekee kpọrọ 'Mace' laa n'obodo ya bụ Ogbunike n'abalị iri atọ na otu ọnwa Maachị afọ 2000. Dịka iwu siri dị, enweghị mkpebi ọbụla e mere ga-enwe isi ma ọ bụru na ya bụ ọfọ ụlọomeiwu anọghị ya. Mgbe ndị uweojii bịara ụlọ ya ị nara ya ọfọ ọchịchị ahụ, ọ gwara ha na ọ ga-anwụ tupu o kwere ka ha were ya. Ụmụaka Biafra: Etu ndị etobeghi ntoroọbịa jiri hụ agha Mana mbọ ahụ ọ gbara amịtachaghị mkpụrụ n'ihi nkata a kpaara ya nke ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụ onyeisiala oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo aka, mechara kpudo ya. E mechara wepụ ya n'ọchịchị dịka onyeisi Sineti. 3. Oyi bụ onwe maara etu e si ahazi okwu Ihe ọzọ ndị mmadụ ji mara Okadigbo bụ na ọ bụ onye nwere nka ịhazi okwu ọ na-atọ ka nnu na ntị ma juputa na nnukwu amamihe. Iji maa atụ, ọ sị ""Ọ bụrụ na ịhụnanya agbụrụ maọbụ okpukperechi maọbụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị mechiri gị anya nke na ịgaghị akwado eziokwu maọbụ ikpe kwụ ọtọ, mara na agụmakwụkwọ ma amamihe gị lara n'iyi. Ọ bụrụ na inweghị ike ichemi echiche dị ka onye nwere akọnuche, mara na ị bụ ọghọm."" 4. Agụmakwụkwọ Chuba Okadigbo Dịka onye agụm akwụkwo na-amasị, Chuba Okadigbo nwetara asambodo Masters na Political Science, ma nweta kwa asambodo dịka ọkammụta na Philosophy na Political sceince. Okadigbo rụru ọru dịka onye nkụzị na mahadum Howard University nke mba Amerịka. 5. Chuba Wilberforce Okadigbo ( Disemba 17, 1941 - Septemba 25, 2003) Chuba Okadigbo bụ nwaafọ Umueri, nke dị n'obodo Ogbunike n'okpuru ọchịchị Oyi nke di na Anambra steeti. A mụrụ ya n'Asaba Delta steeti n'afọ 1941. Okadigbo nwere asambodo ndọrọndọrọ ọchịchị nke Mahadum nke Catholic Universoty Of America dị na Washington DC, ma tụru ugo dịka ọkammụta n'agụmagụ Philosphy na Political Science. Dịka ezigbo nwaafọ Oyi ọ bụ, e chịrị ya echichi dịka 'Oyi Nke Oyi'. Okadigbo nwụrụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2003 site n'aka nsogbu iku ume. Biafra at 50"": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ"" O mere ihe ndi a nile n'ime afọ abụọ site n'afọ 1973 ruo afọ 1975. Okadigbo rụkwara ọrụ na Mahadum nke University Of Nigeria nke di na Nsụkka dịka ọka nkụzi nke Political Sceince ma rụọ kwa dịka ọkankụzi na Bigard Memorial Senior Seminary nke dị n'Enwugwu Steeti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-52594101,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52594101,Pornography: A maala ọkwa ka a kwụsị iji ATM kaadị ele ndị gba ọtọ n'intanetị,A maala ọkwa ka ndị ụlọọrụ na-enye Kadị eji ego ihe ma ọ bụ were ego n'igwe ATM ka ha kwụsị inye oghere ka e jiri kaadị ha akwụ ụgwọ n'ịntanetị.,"Ọ bụ ndị otu zuru ụwa na-ekwu ka nke a mee. Otu ụlọọrụ na-ere ihe onyonyo ndị na-eme mmekọ ahụ bụ ""Porn Hub"" kwuru na ọkwa a bụ eziokwu ma bụrụ kwa asị"". Ndị ụlọorụ Mastercard kwuru na ha ga-ewepụ websaịt ọbụla ha chọpụtara na-eme ihe na ezighị ezi na ndị ha na ha na-arụko. Ndị bidoro iti mgbu a degara ụlọọrụ ndị na-eme kaadị e ji akwụ ụgwọ iri nke gụnyere Visa, MasterCard na American Express. Ndị otu a sị mba Briten, India, Uganda na Ọstralịa. Ọrụ otu ndị a bụ ihu na mmegịde ụmụaka n' ịgba mgbere mmadụ kwụsịrị. Mmekọ dị njọ na-eme na Intanetị Websaịt na-ere mmekọ nwoke na nwaanyị a kpọrọ 'pornhub' so na ndị ha ji maa ọkwa a. N'ọnwa Ọktoba ka e jidere otu nwoke gbara afọ iri ato si obodo Florida aha ya bụ Christopher Johnson ma gbaa ya akwụkwọ maka ịwakpo nwa dị afọ iri na ise ma tinye ya na 'Pornhub.' Kama ndị ụlọọrụ 'Pornhub' na-ekwu na ha na-ewepụ ihe onyonyo mmeko nwoke na nwaanyị na-ezighi ezi. Dịka ọ dị ugbu a, ụlọọrụ ndị na-eme kaadị a ndị gụnyere Visa na Masrercard ka na-ekwe ka ndị mmadụ kwụo ụgwọ ịle mmekọ nwoke na nwaanyị na websaịt dị iche iche. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50457341,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50457341,Zamfara state: Ndị amakekwu agbagbuola mmadụ 14,Akụkọ na-eru anyị ntị taa bụ na ndị amakekwu awakpola obodo Karaye dị na Zamfara steeti gbuo mmadụ iri na anọ ma mụnye ọtụtụ ụlọ ọkụ.,"Ala arụọla na Zamfara Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Muhammad Shehu sị na ndị omekome a ji ọgbatumtu bata na ya bụ obodo kpọpere egbe ha gbawa ewu na ọkụkọ nọchiri ụzọ. Shehu sị na ha na-eche na ọ bụ mbọ ka ndị ahụ bọrọ maka ndị nche obodo ahụ mere ha bụ ebe ha gbara ha tọọtọọ ọnwa gara aga. Mmadụ asatọ nwụrụ na Lokoja Gwongworo bu mmanụ ụgbọala egbuola mmadụ asatọ na Lokoja, Kogi steeti dị ka ọ kụrụ ụgbụọla ndị ọzọ. Ọkụ si na ya gbara ọtụtụ ụgbọala ndị ọzọ nakwa keke dị n'okporoụzọ Felele n'isiobodo ahụ. Akụkọ kwuru na ya bụ mkpamkpa kpara n'ụtụtụ Monde ka gwongworo bu ya bụ mmanụ ụgbọala tụrụ agwa ọcha dakwasara keke anọ, ọgbatumtum abụọ nakwa ụgbọala anọ, dịka ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii na steeti ahụ bụ Emmanuel Abe si kwuo. Abe sị na ""Ihe a metụtara mmadụ iri na asaa; ebe mmadụ asatọ nwụnyụrụ anya pịị, mmadụ asaa ndị ọzọ nọ n'ụlọọgwụ Federal Medical Centre Lokoja anata ọgwụgwọ"". Ndị ọrụ mmenyụọkụ gakwara ebe ahụ gbanyụọ ya bụ ọkụ tupu o mebie ihe karịa ka o mere. E nwere ike ịwe ọkụ n'isi unu mgbe adịghị anya Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa Ọchịchị ga-agba ebe niile na Naịjirịa mgbe adịghị anya. Nke a bụ onu odeakwụkwọ ndị Nigerian Electricity Generation Companies bụ Joy Ogali. Joy sị na ọ bụrụ na gọọmenti etiti adoghị Nigerian Bulk Electricity Trading Company aka na ntị maka oke iwu ha na-etiri ha, na ha ga agba abụbụọrụ. Trump sị na ya na-eche maka ịza ụlọikpe oku N'ofesi, onyeisiala Amerika bụ Donald Trump ekwuola na ya dị njikere ị ga zara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ebubo a na-ebo ya. Trump sị na ihe ya ji echesi ya bụ echiche ike bụ ka ndị omeiwu nwee ike ịdowe nke ahụ n'ụsọ tinye uche na oge n'ezigbo ọrụ. Spain na Romania ga-ekwe n'aka Obi awaala otu egwu bọolụ Romenia mmiri dịka ha ga-ezute Spain taa. Echetere na Spain gbara malta ọkpụ asaa chara acha n'izu gara aga. Gee akụkọ anyị na otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Obi dị anyị ụtọ na-atọghapụrụ Fr. Theophilus - Ụlọụka Katọlik Ụlọụka Katọlik ekeela chineke n'isi Fr. Theophilus nke ndị ntọ tọghapụrụ n'Enugwu. Benjamin Achi bụ onyeisi mgbasaozi n'ụlọụka katọlik n'Enugwu gwara BBC nke a n'ozi ekwentị. ""O nweghi ihe ọzọ n'abụghị ikele chineke na ọ natara n'udo"" ka o kwuru. Ezinaulo father Theophilus Ndulue ekurula ume ndụ ugbua dịka ndị ntọ ntọrọ ya tọghapụrụ ya n'ụbọchị ụka. Cheta na a tọrọ Fr Theophilius na mgbede Fraide mgbe o si nzụkọ ụlọụka alaghachite n'Enugwu. Na Legọs, Ọ bụ taa ka otu na-ahụ maka nchekwa mbaraezi na Legọs kwuru na ha ga-kpụrụ ọdụm n'eche ụlọ mmadụ na mpaghara Victoria Island dị na Legọs. Ndị agbatobi n'ebe ahụ chi obi ha n'aka dịka nwoke ahụ bụ onye India ji ọdụm na-echekwa ụlọ ya. Ihe na-eme n'Afrịka Mba Fransị enyeghachile mba Senegal mma agha dị mkpa nke ha were kemgbe afọ narị ole na ole gara aga. Fransị sị na ha mere nke a iji mezu nkwa ha kwere ịnyeghachi ụfọdụ mba Afrịka ngwa omenala ha ha buru na mbụ. Ọzọ ndị agha mba Burkina Faso egbuola mmadụ iri atọ na abụọ echere na ha bụ ndị na-eyi ndụ egwu na mba ahụ. Akụkọ kwukwara na atọghapụrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ahụ ji dịka ohu mmekọ ahụ n'ịkpa Yorsala. N'egwuregwu, Onye nkuzi otu Lesotho bụ Thabo Senong ebunyela Super Eagles Naịjirịa ụkpa ekele dịka ha merichara ha. Senong gwara ndị ntaakụkọ na ""anyị na otu dị mma sọkọtara mpi, ha merie"". Ọ bịara dịka ugo Naịjirịa atụgbuola agụiyi Lesotho dịka ha kwatara ya n'abalị sunde iji ma onye tozụrụ ịga asọmpị AFCON n'afọ 2021. Ọ bụ ọkpụ goolu anọ asatara abụọ ka Naịjirịa ji nwere mmeri ahụ. Na ntuliaka Bayelsa na Kogi Ọgbakọ Yurop bụ EU ekwola ebumnuche ha gbasara ntuliaka emere na Bayelsa na Kogi na ngwucha izuụka. Ha kwuru na ha nwere ihe akaebe na a zụrụ vootu, zuo igbe vootu nakwa gbuo ọtụtụ ndị mmadụ. Ha tiri ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ aka n'obi." afirika-48328982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48328982,Anglican Church of Nigeria: Ihe anyị dere maka ọchụchụ ndị ụkọchukwu bụ eziokwu,Akụkọ ọzọ pụtara na ndị ụka Anglican nke Isiala Ngwa Diocese dị n'Abia Steeti achụọla ndị ụkọchukwu ha mmadụ anọ.,"A sị ha dara iwu site n'inwe mmekọrịta nwoke idina nwoke bụ 'Homosexual' n'ụzọ dị iche iche. Ozi si n'akwụkwọ ozi Bishọp na-achịkọta Isiala Ngwa bụ Rt. Rev Temple Nwaogu zigara ndị isi ụka Anglican na Naịjirịa kwuru na ha enyochala ma chọpụta na ha mere nke a n'eziokwu. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Bishọp na-achịkọta Isiala Ngwa Diocese bụ Rt Rev. Temple Nwaogu, o kwuru na nke a bụ eziokwu na-achụrụ ndị ụkọchukwu ha mmadụ anọ. O kwuru na ha mere nyocha ma chọpụta na ndị ụkọchukwu a nwere mmekọ nwoke idina nwoke nke mere e ji chụọ ha. Rev Nwaogu sị na ụka Anglican nwere usoro ha ji eme ihe bụ nke o merela site n'izi ndị isi ụka Anglican ozi banyere nke a. Ọ gara n'ihu kwuo na ha achọghị ka eburu akụkọ a na-efegharị n'ụzọ na-adịghị mma, na ha emela ihe ha kwesiri ime. Cheta n'oge na-adịghị anya, ụka Anglican nke diocese Ohafia/Arochukwu dị kwa n'Abia Steeti chụrụ ndị ụkọchukwu ha abụọ n'ihi idina onwe ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-47998484,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47998484,Man City vs Tottenham: Man City agbarala isi onwe ha,Manchester City na Tottenham nwalere onwe ha ọzọ taa mana nke a bụ n'asọmpi Ịnglish Premier League.,"Ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ ""Man City ọ ga-eji iwe mgbapụ Tottenham gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa Champịọns merụọ ha ahụ na nke Premier League?"" Ka ha a ga-anọ na mmiri ncha aba ha anya ọzọ?"" N'iji zaa ajụjụ nke mbụ, Man City n'egbughi oge sụnyere goolu ha na nkeji 5 site n'aka Philip Foden, nke a bụ goolu mbụ nwa amadị a na-enye n'asọmpi Premier League. Oke ihe mere Man City mgbe onye otu egwu ya bụ Kevin de Bryune gbara ụkwụ ọcha n'ikpere n'ime nkeji 38 nke mere e ji wepụ ya. Ndị otu egwuregwu abụọ ndị a kere nkwụcha rue na nkeji 45 mgbe agba nke mbụ gwụrụ. Dịka agba nke abụọ malitere, ọ dịka a ga-asi na Man City chakere ọkụ mana Tottenham ekweghị ha nyee goolu ọzọ. N'otu aka ahụ Tottenham nwakwara ike Man City ọtụtụ oge mana ọ mịtaghị mkpụrụ rue oge asọmpị ahụ gwụrụ na nkeji 90. Mmeri a Man City ji otu ọkpụ merie Tottenham nyere ha ohere ịlaghachị n'isi tebụlụ Premier league n'ọnụọgụgụ 86. Ha ji otu ọnụọgụgụ karịa Liverpool bụ ndị nọ na 85. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50365025,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50365025,Nnamdi Kanu: 'Ihe m chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa',Nnamdi enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ,"Akụkọ dị mkpa: Onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ ga-eme ka ya na ha nwee mkparịtaụka. N'ozi si n'aka odeakwukwọ Ipob bụ Emma Powerful pụta, Kanu sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa jiri obi ọcha kpọ ya oku n'obodo ọzọ nakwa n'ihu otu United Nation. Ọ sị na oku a ga-abụ maka ihiwe mgbe na etu a ga-eji mme ntuliaka nwereonwe ndị Biafra bụ 'Referendum'. Kanu gara n'ihu kwuo na ihe mere o ji a chọ ebe ọnọdụ dị mma maka mkparịtaụka bụ maka mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ya n'afọ 2017. Ọ sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa chọrọ ịgba ya ajụjụ, na gara ezite ndị DSS maọbụ ndị uweojii kama izite ndịagha ka e gbuo ya na 2017. Kanu sị na ugbua nne ya anwụọla, ahụ esichaghị nna ya ike n'ihi mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ha. Ụmụaka a lụnyere dị ka nkụ na Naịjirịa - UNICEF Ndị ugwụ Awụsa kachasị nwe ụmụaka anaghị aga akwụkwọ na Naịjirịa Ngalaba United Nation na-ahụ maka ụmụaka bụ UNICEF sị na Naịjirịa kachasị nwee ụmụaka a lụnyere di na nwata n'Afrịka. Ozi ha wepụtara ụnyaahụ na Bauchi Steeti kwuru na ụmụnwaanyị dị nde iri abụọ na atọ na Naịjirịa bụ ndị a lụrụ dị na nwata. Onaiyekan alaala ezumike nka Onyeisi ụka Katọlik n'Abuja bụ 'John Cardinal Onaiyekan' alaala ezumike nka. Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu ga-ala ezumike nka ma ha gbaa afọ iri asaa na ise. Onaiyekan gbara afọ iri asaa n'otu n'ọnwa Janụwarị afọ a. Akwụkwọ ozi si n'aka ndịisi ụka Katọlik n'Abuja kwuru na Pope Francis ahọpụtala Ignatius Kaigama dịka onye ga-anọchị anya Onaiyekan. Akpabio ọ ga-ahapụzị mịnịsta lagachi ịzọ ọkwa Sịnetọ? Ụlọikpe mkpesa kagbuola mmeri Chris Ekpeyong meriri Godswill Akpabio n'ịzọ ọkwa sịnetọ ga-anọchịteanya Akwa Ibom West. Ụlọikpe a nyere iwu ka e megharịa ntuliaka a n'okpuruọchịchị Essien Udim bụ ebe obodo Akpobio dị. Pati PDP n'Akwa Ibom nabatara ikpe a ma kwuo ha nwere olileanya imeri Akpabio ọzọ. Dịka ọ dị ugbua Akpabio ji ọkwa mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta. Ajụjụ a bụrụ ma ọ ga-agbahapụ ọkwa mịnịsta zọọ nke sịnetọ? NYSC achụọla ụmụagbọghọ abụọ n'Ebonyi Steeti Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ngalaba NYSC chụpụrụ ụmụ agbọghọ abụọ bịa iji otu afọ efe ala nna ha n'Ebonyi Steeti. Akụkọ a sị na ụmụagbọghọ ndị a jụrụ iyi 'Traouser' dịka o megidere okpukperechi ha. N'ofesi Evo Morales Onyeisiala mba Bolivia bụ Evo Morales ekwetala na ya ga-akagharị ntuliaka elu ọzọ n'ihi ebubo ndị mbaụwa na-ebo ya na o ji nrụrụaka wee merie ntuliaka nke mbụ e mere n'ọnwa Ọktoba. Nke a bụ nke ugboro anọ Morales na-azọ ọkwa onyeisiala Bolivia, ọ malitere ịchị mba ahụ n'afọ 2006. Ọkụ ọhịa egbuola ihe ruru mmadụ atọ ma ma chụsịa ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọ dị n'Ostrelia. Ndị ọrụ gbatagbata sị na ihe karịrị ire ọkụ otu narị ka na-agba na mpaghara South Wales nakwa Queensland. N'egwuregwu Ndị otu egwu bọọlụ Manchester United mere ka ọbụghị ha taa mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ndị Brighton. Etu ahụ kwa ka Liverpool si merie ndị Manchester City. Lionel Messi nyere goolu atọ mgbe ndị Barcelona ji ọkpụ goolu anọ asatara otu merie Celta Vigo n'ụbọchị Satọde. Nke a mere ka Barcelona gbagoro n'elu tebulu 'La Liga'. Nwafọ mba Briten na-akwụ ọkpọ bụ KSI emeriela ogbo ya nke Amerịka bụ Logan Paul n'asọmpi ọkpọ ha kụrụ na Los Angeles. N'asọmpi Premier League nke ehihie a Manchester United na Brighton ga adọbiri ya ebe Liverpool na Manchester City ga-ezute ibe ha. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Agaghị m agbatịnwu aka m mana a ga m agbatịnwu ụbụrụ m'" afirika-49162099,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49162099,Abubakar Shekau ọ bụzị anwụanwụ?,"O meela afọ iri kamgbe ndị otu Boko Haram bidoro kpawa ike ọjọọ na Naịjirịa, na-egbu ndị mmadụ, na-atụ ogbunigwe, ma na-atọrọkwa ndị mmadụ.","Nke a bidoro dịka ndị uwe ojii gbuchara onye malitere otu ahụ aha ya bụ Mohammed Yusuf n'afọ 2009. Kamgbe ahụ, puku kwuru puku mmadụ anwụọla n'aka ndị otu ọjọọ a akpọrọ Boko Haram, tụmadị na mpaghara ugwu Naijiria. Ndị agha ndị Naijiria nakwa agba mbọ kamgbe ahụ iji kwụsị ya bụ otu, mana onwebeghi isi. Ugboro ugboro ka ndị isi ndị agha Naijiria kwuru na ha egbuola Abubakar Shekau bu onye isi ndi Boko Haram. Mana ha ncha bụcha asị asị n'ihi na Shekau ka dị ndụ ebe ndị otu ya ka na-eyi Naijiria niile egwu. Lee ugboro ise e kwuru na Shekau anwụọla: Abubakar Shekau kwuru na ọ chọrọ ịkewara obodo nke aka ya ebe onye ọbụla ga Dapchi: Gọọmenti emeribeghi Boko Haram - Massob 'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa Boko Haram ji 'drone' enyo anyị - Ndị agha Naịjirịa Boko Haram mechara kewaa ụzọ abụọ Ka ọ dị ugbua, otu ndị Boko Haram agbakeela ụzọ abụọ, otu ụzọ gaa dịnyere ndị otu oyi egwu nke mba Iraq a kpọrọ ISIS. Ihe Buhari gwara ndị agha na Maiduguri Hapụrụ anyị ụmụ anyị - Aisha Buhari Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Ha na-akpọ onwe ha ""Islamic State in the West African Province"" (ISWAP). Cheta na ọ bụ ndị otu ọjọọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị 276 n'ụlọakwụkwọ ha na Chibok, Borno Steeti, n'afọ 2014. N'afọ 2018, ndị Boko Haram tọrọkwaara ụmụakwụkwọ otu narị na ise n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti, mechaa tọhapụ ha. Mana otu onye n'ime ụmụakwụkwọ ahụ aha ya bụ Leah Sharibu ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram. Akụkọ kwuru na gọọmentị kwụrụ Boko Haram nnukwu ụgwọ tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ, mana gọọmentị ka na-agọ agọ. Akụkọ na ihe nkiri ga-amasị gị: Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ" afirika-46554521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46554521,Air Peace: Ọ fọrọ nwa ntịị ka ọdachi mee n'ụgbọelu Air Peace?,Otu nwaada akpọrọ Chinyere Anigbo agaala na soshal midia kọwa ahụmihe ya n'ụgbọelu 'Air Peace' nke si Legọs aga Enugwu n'ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa Dizemba 2018.,"End of Instagram post, 1 O kwuru na nsogbu dị n'ụgbọelu bidoro tupu ha efelie elu ndịọrụ Air Peace siri ha ritue dịka e bidoro ọrụ na injin ụgbọelu ahụ. Ọ kọwara etu ụfọdụ mmadụ anwụrụ ume nke bụ Oxygen na Bekee siri datuo nke butere na ụfọdụ mmadụ kuburu nakwa na ndị nọ nso bidoro inyere ha aka. Ihe akpọrọ 'Oxygen mask' daturu mana anwụrụ oxygen apụtaghị n'ụfọdụ ndị njem dịka o siri kọwa. End of Instagram post, 2 Anigbo na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere sị na onye ọbụla nwe ngalaba ụgbọelu gba mbọ tinye anya n'ịhụ na eletakwara ya, ma haziekwa ya ọfụma. O kwuru na ahụmihe a emeela na ọ bụzị sọsọ njem ụgbọala ka ọ ga-na eji eme njem dịka ọ na-ekele chukwu na ha daturu n'udo n'agbanyeghi ihe mberede kwadoro ime. Air Peace: Onye njem agbaala ama maka ihe ụgbọelu ahụ mere akpa ya Mgbe BBC Igbo kpọrọ Air Peace ịnụ olu ha, ọnụ na-ekwchitere ha bụ Maazị Chris Iwarah kwuru na ha ma na ihe dị etu ahụ mere n'ezie. Mana ọ gọrọ na ụfọdụ ihe Chinyere Anigbo kwuru mere dịka na usoro anwụrụ oxygen anaghị arụ ọrụ ọfụma nakwa na ụfọdụ ndị mmadụ kuburu na njem ụgbọelu ahụ. O jikwa ohere ahụ rịọ mgbaghara maka ndị niile nọ na njem ahụ, okwu a metụtara. Akuko ndị ọzọ ga-amasị gị:" 53422613,https://www.bbc.com/igbo/53422613,Imo state governoship Election: A kpụpụla Uzodinma n'ụlọikpe ọzọ maka okwu ntuliaka 2019,Onye ọzọ achịpụla Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti ụkwụ n'ama ọzọ dịka o si metụta ntuliaka gọvanọ nke afọ 2019 bụ nke o wepuru ikpe n'ụlọikpe.,"Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Wenezde kweta ịnụ mkpesa dị n'akwụkwọ nke otu onye ndorọndọrọ ọchịchị gbara iji chutuo Uzodinma n'oche Gọvanọ Imo Steeti. N'akwụkwo ikpe bu akara FHC/ABJ/CS/656/20 nke ọkaiwu Kingdom Okere bụ onye fere ọkọlọtọ otu pati 'Reform and Advancement Party (RAP) gbara, o kwuru na Hope Uzodinma ịnọ n'ọkwa gọvanọ megidere iwu n'ihi na o soghi zọọ ntuliaka 2019 n'aha pati ọbụla. Okere chọrọ ka ụlọikpe kọwa ma ọ bụ Hope Uzodinma ka APC nyere nkwado ịzọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka e mere na steeti ahụ n'afọ 2019. O gwara BBC Igbo n'ekwentị na akwụkwọ ahụ ya gbara gbadoro ụkwụ na ""Uzodinma na-achị Imo Steeti n'ụzọ iwu na-akwadoghi. Uzodinma azọghị ọkwa gọvanọ."". Ọ sị na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere nke kwuru na ọ bụ Uche Nwosu ka APC họpụtara n'ezie ka ọ fee ọkọlotọ ha na ntuliaka gọvanọ, ebe ọ bụkwa ụlọikpe kachasi kwukwara na Nwosu agaghị abụ onye na-anọchite pati abụọ; APC na AA n'otu ntuliaka maka ọkwa gọvanọ. Okere rịọrọ ụlọikpe ka ha tụlee ikpe ahụ ngwangwa n'ihi na dịka o siri kwuo, okwu ahụ bụ okwu dị mkpa. Mana ọkaikpe Inec bụ Alhassan Umar, riọrọ ka e nye ha ohere iji saa okwu n'ikpe ahụ. N'ịtụnye ọnụ n'ikpe ahụ, Jọstis Okon Abang yigharịrị ya n'ụbọchị Julaị 20, afọ 2020 bụ oge o kwuru a ga-anụ mkpesa ahụ. N'ọsịsa ha, ọnụ na-ekwuru Uzodinma bụ Ogwuike Nwachukwu si na akwụkwọ ahụ agbara bụ njem e ji azụ aga, ""Ọ bụ njem enweghị ebe ọ na-eduga, nrọ nwakanchi"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49720178,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49720178,Igbo Folktale: Ihe ụmụ anụmanụ pụtara n'akụkọ ifo Igbo,Akụkọ ifo Igbo bụ otu njirimara ndị Igbo ha ji agbasa ozi maka ihe dị icheiche.,"Ịmaatụ eji akụkọ ifo akuzi amamihe, eji ya akọ akụkọ oge gboo, eji ya enye ndụmọdụ wdgz. Ụfọdụ oge, akụkọ ifo na-eji ụmụ anụmanụ a ma atụ n'ime ya iji gosi agwa ọma maọbụ agwa ọjọọ nakwa ịmụta ihe. Osita Amakeze bụ onye odeeakwụkwọ kọwara anyị maka ndị kachasị apụta n'akụkọ ifo na ihe e ji mara ha. Mbe Mbe bụ otu anụmanụ a ma ama na-apụtakarị na akụkọ ifo Igbo dị icheiche Maazị Amakeze kwuru na ọ bụ aghụghọ ka eji mara mbe. Ị chetara akụkọ mbe na nkịta na nti ele? Enyi O kwuru na ihe eji mara Enyi bụ ibu n'ihi etu ọ ha. Enyi abụghị anụmanụ dị obere ma ncha ya mere ụmụ anụmanụ ibe ya jiri na-agụ: ""Enyi na-aga n'anyị so gị n'azụ"" Agụ/Ọdụm Ụfọdụ akụkọ na-ewe agụ na ọdụm ka ha abụ otu ihe n'ihi na ha yiri onwe ha. Ha nwekwara agwa yiri ibe ya nke bụ na eji ike mara ha. Ị lebanye anya n'akụkọ ifo ụfọdụ, ị ga-ahụ na ọ bụ agụ na ọdụm ka e chere kachasị ike. Awọ Ndị Igbo tụrụ ilu sị na ""akụ fechaa ọ dara awọ"" Nke a mere ejiri jiri ndidi mara awọ. O nwere anụmanụ ọzọ yiri awọ nke Igbo kpọrọ Mbala. Omume ha yiri mana ha abụghị otu ihe. Ihe nkiri ga-amasị gị Osita Amakaeze: Ndị ntorobia chọrọ ndị ndu ga-ezi ha ụzọ ọma" afirika-45612618,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45612618,Osun 2018: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ na-azụ vootu,Ndị uweoji ekwuola na ha nwụchiri ụmụnwoke abụọ bụ ndị echere na ha na-ego votu na ntuliaka ahụ.,"Osun 2018: ""Vootu gị bụ ike gị, ere na ya"" Ndị uweojii kwukwara na ha jidere ha ebe ha ji ego karịrị narị puku isii ma bidokwa nyocha. Amabeghi otu ndọrọndọrọ bụ ndị dupuru ha n'ọrụ a rue ugbua. Cheta na ndị ntaakụkọ BBC nọ n'Osun steeti na-ekwu na igwe mmadụ pụtara ya bụ ntuliaka. Ha kwukwara na ndi ọrụ nchekwa dị icheiche pụtara n'uju ha nke gụnyere ndị agha, ndị uweojii, ndịọrụ 'civil defence' ma ndị ji otu afọ efe ala nna ha. Mmadụ iri anọ pụtara ịzọ ọkwa Gọvanọ Osun steeti ahụ. Ademola Adeleke ama dịka 'dancing senator' pụtara tunye votu ya. Adeleke nọchịrị anya PDP na ya bụ ntụlịaka. Ademola Adeleke atụọla votu ya Ibe ya bụ Isiaka Oyetola nke na-anọchi anya APC atụọla votu ya. Oyetola don vote Igwe mmadụ pụtara ịtunye votu ha. Ntuliaka na-aga n'ihu n'Osun state Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị pụtara ịkwado ibe ha. Anaghị eji afọ egwu egwu dịka ndị pụtara ịtụ votu na-ego ihe oriri. Pipo wey come vote buy food to chop Akụkọ ga-amasị gị" afirika-55185282,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55185282,Ndị tụrụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike ha bụ ndị otu IPOB?,"Ọkaiwu ndị otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Alloy Ejimakor ekwuola na mmadụ atọ ndị uweojii gbara n'anwụ maka ịtụ ogbunigwe n'otu ụlọụka na Port-Harcourt, abụghị ndị otu IPOB.","Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike Ndị uweojii gbara mmadụ atọ n'anwụ n'ụbọchị Tọzde ma kwuo na ha sara asịsa na ha bụ ndị Ipob. Aha mmadụ atọ a bụ: Progress Owudinjo, onye Etche, dị na Rivers Steetị; Apuro Victor, onye Ebonyi Steetị, na John Okorie, onye Abia Steetị. Ndị uweojii kwuru na mmadụ atọ ahụ sara asịsa ma kwuo na ihe ha ji mee ya bụ ihe a bụ iji gbagote n'ọkwa n'otu IPOB. Ndị ahụ kwukwara na ebumnobi ha abụghị igbu onye ọbụla, ya kpatara ha ji were abalị gaa ya bụ ije. Ihe IPOB kwuru Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu ndị Ipob na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu Alloy Ejimakor bụ ọkaiwu Ipob gwara BBC Igbo na ""ọ bụ ebubo ụgha ka gọọmentị Rivers na ndị uweojii na-ebo Ipob"". ""Ndị ahụ ndị uweojii gbara n'anwụ abụghị ndị Ipob."" ""Ọ bụrụ na ha bụ ndị Ipob, ndị otu ahụ agaghị agbahapụ ha. Ipob anaghị agbahapụ ndị otu ha."" ""Ipob abụghị otu na-achọ ọgbaaghara, ha bụ otu udo. Ha amaghị etu e si arụpụta ogbunigwe."" ""O doro anya na ndị na-arụ ogbunigwe na Naịjirịa bụ ndị Boko Haram na ISWAP."" Ndị e boro ebubo ịtụ ogbunigwe n'ụlọọụka nna Nyesom Wike Ejimakor gara n'ihu kwuo na o kwesịghị ekwesị n'iwu etu ndị uweojii si akpụpụta ndị mmadụ gbaa ha n'anwụ n'ihi ebubo na ha kpara arụ. ""Ọ bụ naanị ụlọikpe nwere ikike ikwu ma mmadụ ọ dara iwu maọbụ ọdaghị iwu, ọ bụghị ndị uweojii."" Ihe ndị uweojii kwuru Onyeisi ndị uweojii nke Rivers State Joseph Mukan N'okwu ya oge ha na-agba mmadụ atọ ahụ n'anwụ, onyeisi ndị uweojii Rivers steei bụ Joseph Mukan, kọwara na ha nwetara ozi na ndị ekperima wakporo ụlọụka a kpọrọ 'Christian Universal Church' nke dị n'Azikiwe Road na Portharcourt. Oge ha rutere ebe ahụ, ndị nche ogbe ahụ ejidela mmadụ atọ n'ime mmadụ isii ha kwuru mere ya bụ ihe. Ndị nche ahụ hafere mmadụ atọ ahụ ha jidere n'aka ndị uweojii. Mukan gara n'ihu kwuo na ha ka na-achọ mmadụ atọ ndị ọzọ gbara ọsọ, nakwa ndị zipuru ha ya bụ ije. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers bụ Nnamdi Omoni, ka ọ kọwaa nke ọma ihe gbasra akụkọ a, mana ọ zaghị ekwentị ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe mere m ji eji ọnụ, ụkwụ, ntị n'akụkụ ahụ m ndị ọsọ ese ihe" afirika-52609849,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52609849,Bob Marley: Ihe o ji bụrụ eze 'Raggae',Bob Marley bụ odogwu nwoke ji egwu na nka gbanwee omenala nakwa echiche na nkwenye ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburu gburu.,"Kemgbe ọ nwụrụ n'ụbọchị iri na otu ọnwa mee afọ 1981, ude, ebube na ọrụ ọma ya malitere ịgbasa karịa ka ọ dị mgbe ọ dị ndụ. Ihe buliri ya elụ otu a bụ ọrụ ọma ya n'iti egwu nke o ji ekwupụta mmegbu, mkpagbu na uru ọ bara mmadụ ileghere ahụhụ ụwa anya, nwewe aṅụrị bụ nke ọ ọkụrụ na egwu mgbe ọ sị, ""forget your troubles and dance"" . Ọ gbasakwara ozi ihunanya nke ukwu bụ nke o gosiri na egwu ya bụ ""One Love"". Ị ji mata nke a, mgbe ọ nwụrụ ka e ji nye ya nturuugo ""Rock and Roll Hall of fame"" n'afọ 1994. Na 1999 ka Times Magazine ji nye egwu ya nke ọ kụrụ n'afọ 1977 a kpọrọ ""Exodus"" nturuugo ọbaegwu bụ ọkaibe na narị afọ, ya bụ ""Album of the Century award"". N'otu aka ahụ ka ha ji nye egwu nke ọ kpọrọ ""One Love' ""Song of the Millenium"". Kemgbe o wepụtara albọm ahụ ọ kpọrọ ""Legend"" n'afọ 1984, ya bụ egwu na-ere ihe karịrị narị pụkụ abụọ na iri ise (250,000) kwa afọ, nke tinyere ya n'ọkwa iri na asaa egwu merela etu ahụ kamgbe ndị 'Sound Scan' malitara ịgụkọ egwu mere nke ọma n'afo 1991. N'afọ 2001 ka e nyere ya nke kacha nke bụ ""Grammy Liftime Achievement Award"" bụ echichi a na-echi naanị ndị bụ ochiedike n'egwu. Ihe ndị niile mere Eze Ndu, onye malitere na nwata kpọwa egwu Bob Marley ji sị na ""ọnwụ ya bụ nwaamadị dịka ọnwụ Jesus Christ maka na ndị mmadụ chọpụtara uru ọ baara n'ọnwụ ya"". Eze sịkwa na ""Bob Marley bụ mmụọ, bụrụkwa mmadụ"". Ọ kọwara na ya bụ nwaamadị ji ahụhụ nne ya tara dịka onye isiojii were mara ahụhụ ndị ọzọ na-ata n'obodo ya bụ Jamaica wee si otu ahụ gbawara mmadụ niile ọgọ site n'egwu ya pụrụiche a kpọrọ Reggae. Eze sị na ""mụ na onwe m na-ahụ Bob Marley ka mụọozi bịara n'ụdị mmadụ izi ozi maka ọdịmma mba Afrịka"". Ọ sị na ""mgbe Bob Marley dị ndụ, ndị be anyị amaghị na ọ bụ onye amụma. Ọ bụ mgbe ọ nwụrụ ka a bịara chọpụta n'ezie na ọ bụ onye ammụma"". Eze Ndu bidoro na nwata kpọwa egwu Bob Marley Dịka o si maa atụ, ""ncheta a na-echete Bob Marley dịka nchete ndị otu krịast na-echeta ya maka ọ mere ka ọtụtụ n'ime anyị chọpụta ihe anyị amaghị gbasara ndụ anyị na-ebi, gbasara ka e si kee anyị n'ụwa a na mmegide a na-emegide anyị nakwa nkata dị iche iche bụ nkata ọjọọ ndị ọcha kpara megide ndị isi ojii"". Eze sị na Bob Marley mere ka ndị isi ojii mara ka anyị bụ ndị isiojii ga-esi jikọ onwe anyị ọnụ. O wutere Eze na onwebeghị ebe ọbụla n'ala igbo eji aha Bob Marley gụọ okporoụzọ dịka e si eji aha ndị ọzọ. Ọ rịọrọ ndị isi ọchịchị, ọkachasị n'ala Igbo ka ha kawa ahụ nwere aha ya gụọ okporoụzọ dị mkpa maka ncheta ya bụ odogwu nwoke. Bob Marley chọpụtara na-ọnwere ọrịa Kansa na mkpuru ukwu ya na 1977. Ya na ya bụ ọrịa gbagidere mgba ruo 1981 bụ mgbe ọ nwụrụ na ụlọọgwụ dị na Miami n'ọnwa Mee afọ ahụ. A mụrụ ya n'ụbọchị isii ọnwa febụwari 1945. Bob Marlye ji egwu ya kpezie ndí isi ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ bụ Michael Manley na Edward Seager na-ese okwu mgbe ahụ na Jamaica Marley mụrụ ụmụ iri na abụọ nke gụnyere ụmụ nwoke asaa na ụmụnwaanyị ise. Damian bụ nke mbụ, Ziggy sowe ya. Nke ikpeazụ bụrụ Robert. Nke a bụ afọ iri atọ na itoolu Bob nwụrụ. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48729283,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48729283,Nigeria Vs Burundi: Super Eagles amalitela njem ịchọ Iko AFCON nke 4 ha,Iko Mba Afịrịka nke Bekee kpọrọ African Cup of Nations malitere ụnyaahu na mba Ijipt ka mba ahụ na Zimbabwe suru mpi n'ama egwuregwu dị na Cairo.,"Taata, Super Eagles nke Naịjirịa - bụ ndị tụrụ ugo n'asọmpị a ugboro atọ n'oge gara aga - ga amalite ịchu iko nke anọ ha n'ama egwuregwu Alexandrịa di n'obodo Alexandrịa mgbe ha zutere Burundi. N'ụbọchị nke 26 nke ọnwọa Juun ha ga-ezute otu egwuregwu mba Guinea. N'ụbọchi 30 nke ọnwa juun kwa, ha ga-agba bọọlụ nke agba nke mbụ mgbe ha na Madagascar zutere. Agbanyeghị na Super Eagles so n'otu egwuregwu na-eme ọfụma n'Iko Mba Afịrịka kwamgbe, afọ bụ nke mbụ ha na-agba ya bụ asọmpị kemgbe ha maburu Iko ahụ n'afọ 2013. Super Eagles achịtaghị aja n'asọmpị eji ahụpụta ndị ga-aga Iko Mba Afịrịka n'afọ 2015 nakwa afọ 2017. Mikel Obi nwereike na ezumike nka na Super Eagles ma agbacha asọmpị a Super Eagles butere Iko a mbu n'afọ 1980 mgbe Naịjirịa nabatara mba Afịrịka ndị ọzọ. Afọ iri ano gara tupu ha ebute ya ọzọ na Tunisha n'afọ 1994. Ndị ahụ butere mgbe ahụ bụkwa ndị Clemence Westerhof du gawa Iko Mba Ụwa na Amerịka n'afọ ahụ. Afọ iri na itoolu gara tupu Super Eagles hụ Iko ahu anya na mba Saụt Afịrịka. Onye du ha ga Saụt Afịrịka bụ Stephen Keshi - bu onye anọghịzị n'ụwa. Samuel Kalu dara n'ama egwuregwu, mana dọkịnta sị ọ bụ miri ezughi n'ahụ mere ya Stephen Keshi sokwa n'ime ndị butere iko ahụ n'afọ 1994. Ọ bụ ya bu onyeisi ndi ọgba bọọlụ Super Eagles mgbe ahụ. Ya bụ, Keshi butere Iko ahụ ka onye na-agba nakwa onye nkuzi. Mikel Obi, bụ onyeisi Super Eagles ugbua, sokwa ndị butere Iko ahụ n'afọ 2013. Iko Mba Afịrịka nke afọ bu opuruiche, dịka ọ bu mbu mba 24 ga-ezute na ya bụ asọmpị. Nke afọ a bụkwa nke mbụ ahaziri ka ọ gharị ịdabanye mgbe ndị mba Yurope - bụ ebe ọtụtụ ndị na-agba bọọlụ n'asọmpị a na-atụ mgbere bọọlụ - na-asụ mpị otu egwuregwu dị iche iche. Na mbụ, ọ bụ na ọnwa Febuwarị ka a na-agba asọmpị a. Stephen Keshi butere Iko Mba Afịrị ugboro abụọ, ka onye na-agba nakwa onye nkuzi Dịka ọkwa ha dị n'Afịrịka, onweghị ndị n'ime ndị ha na Super Eagles nọ na ""Group"" enwereike sị na aka siri ike ruo ha n'asọmpị bọọlụ, nke mere ọtụtụ mmadụ na-eche na ha ga-pụta na agba nke mbụ gaa agba nke abụọ. Mana, ndị ma egwuregwu bọọlụ ọfụma na-ekwu na onweghị onye a ga-asị na ọ bụ obele mmadu n'ama egwuregwu." afirika-45430733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45430733,Ebumọnụ ụbọchị 40 egbuola nwata Naịjirịa,"Nwoke Naijiria nwa ya nwụrụ dịka ya na ezinaụlọ ya na-eme ekpere na ebumọnụ abalị 40 ekwuola na ihe mere ha jiri banye ebumọnụ abalị 40 bụ na ha na-atụ anya ""ngozi n'aka Chukwu.""","Titilayo na Kehinde Omosebi na-eme ebumọnụ ụbọchị 40 Ndị uweojii mpaghara Reedsburg dị na Wisconsin nke mba Amerịka nwụchiri nwoke aha ya bụ Kehinde Omosebi na nwunye ya bụ Titilayo maka ọnwụ nwa ha nwoke dị afọ 15 n'ihi oke agụ. N'akwụkwọ mkpesa nke BBC Igbo natara ndị uweojii mba ahụ, Kehinde gwara ndị uweojii na ihe kpatara ha jiri eme ebumọnụ ahụ bụ na ""ha na-eche ngozi sị n'aka Chukwu."" Omosebi na ezinaụlọ ya bidoro ebumọnụ ahụ n'abalị 19 nke ọnwa Julai, afọ 2018, ebe nwa ha nwụrụ ụbọchị ụka bụ abalị 31 nke ọnwa Ọgọstụ, ụbọchị ngwụcha ebumọnụ ahụ. Ndị uweojii kwuru na na ọ bụ Kehinde Omosebi jiri aka ya bịa kpesara ndị uweojii na nwa ya nwụrụ. Ndị uweojii gara n'ụlọ nwoke ahụ bụ ụkọchukwu n'ụlọụka a kpọrọ,'Corner Reformation Ministries', gbawa ụzọ n'ihi na e jiri igodo kpọchie ya n'ime,were chọpụta na nwunye nwoke ahụ na nwa ha ọzọ dị afọ 11 nọkwa n'ọnụ ọnwụ dịka ha tara ahụ n'ihi oke agụụ. Ha kpọgara nwunye nwoke ahụ aha ya bụ Titilayo Omosebi na nwa ha ahụ ụlọọgwụ mana nwaanyị ahụ jụrụ nleta n'ihi okpukpere chi ya. N'ajụjụ ọnụ ha gbara ya ka ọ natatụrụ nleta nwata ahụ gwara ndị uweojii na ọ bụ nnanị mmiri ka ha nụrụ n'abalị 40 ahụ ha mere ebumọnụ. Ndị uweojii nwetakwara n'ụlọ ha akwụkwo ozi gbatagbata nwata ahụ degara ndị ụlọikpe sị, "" Agụụ akarịala. Bikonụ gbata nyere m aka ka m rie nr. ""Ọ bụrụ na m gaa n'ihu na-erighị nri e nwere m ike ịnwụ n'agụụ."" Ndị uweojii gara n'ihu nwụchie ya na di ma buga ha ụlọmkpọrọ. 'Ha kọwara,"" A nwụchiri Kehinde na Titilayo, nne na nna mụrụ ụmụaka ahụ ma buga ha ụlọmkpọrọ 'Sauk County' ebe a gbara ha akwụkwọ maka ịgbahapụ nwa ha nke mere ka nwa ha nwụọ nakwa maka ịgbahapụ nwa ha mee ka o merụọ ahụ ebe ọ dị ukwu."" Ikpe ahụ ga-amalite ma ndị uweojii mechaa nyocha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45290383,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45290383,'Gọọmentị Buhari tọghapụ ụmụnwaanyị Ipob' - ICCA,N'akwụkwọ ozi ha degara BBC ha kọwara agwa gọọmentị kpasoro ụmụnwaanyị a dika oke mmegbu akpachara anya eme ndị Igbo.,"Ụmụnwaanyị anọọla otu izu ụka na nga. Ha kwukwara na ihe mere nụ ga-eme ka ọgbaghara daa n'Obodo. Onyeisi otu ICCA bụ Ugochukwu Okoro kwuru na ndị otu ha na-adọ aka na nti gbasara ụzọ ọchịchị Buhari sị asa ihe gbasara ndị Igbo ga-ebute nsogbu ma ọbụrụ na-akwụsịghị ya. ""N'ọnụ ha,""nwụchị a anwụchiri ụmụnwaanyị anyị ruru 114 na-eme ngagharị iwe n'udo maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo dika ndị nwere ikike ime ya bụ nnukwu nsogbu."" Okoro kwuru na eji mkparịtaụka wee mara ndị Igbo n'igbo nsogbu ọ bụla ha na ndị ọzọ na-enwe ma na-ayọkwa ndị ntorobia ka gharị ikw ka onye ọbụla mechie ha ọnụ sịte n'imekpa ha ahụ. ""Anyị chọrọ ka mwakpo a na-awakpọ ndị Igbo kwụsị."" Anyị na-agwa gọọmentị ka a tọhapụ ụmụnwaanyị 114 ụlọikpe S.K. Kadurumba nyere iwu ka akpọchie. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49142683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49142683,Southgate Preacher: Oluwole Ilesanmi eritela mmeri n'aka ndị uweojii Britain,Oluwole Ilesanmi bụ ụkọchukwu na mba Briten eritela puku pounds abụọ na ọma ise n'aka ndị uweojii mba Briten maka nwụchi ezighi ezi.,"Pastor Oluwole Ilesanmi na-achọ nchekwa pụrụiche n'ebe ndị mgbasaozi nọ Nke a mere dịka achọpụtara na nwụchi a nwụchiri ya n'ọnwa Febụwarị ebe ọ na-agbasa ozi ekwesighi ekwesi. Ndị uweojii mba Briten kwukwara na ha nwere ikike ịnyocha ebubo ọbụla maka ịkpọ asị dịka eboro Ilesanmi Na Naịjirịa Abubakar Malami bụbụ Minista na-ahụ maka Ikpe na Onyeisiala Buhari Onyeisiala Naịjirịa amanyela iwu ga-ekpokọba kọmiti nke ga-ahụ na nkwekọrịta African Continental Free Trade Area (AfCTA) bịara na mmezu n'ala Naịjirịa. Ozi ahụ si n'obi gọọmentị etiti pụta na-ekwukwa na ụlọọmeiwu ukwu ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ na nsonso a. Ọzọ, Peter Ozo Esan bụ odeakwụkwọ ndị NLC si na nnukwu ego ndị NASS na erị n'ọnwa na-ebụisi Onye ọdeeakwụkwọ otu NLC bụ Peter Ozo-Eson ekwuola na gọọmentị etiti na ndị kọmịtị na-elekọta ndị ọrụ ga-ebido mkparịtaụka ọhụrụ n'izuụka a na-ebido maka ụgwọ opekatampe ndị ọrụ, n'ihi na nzukọ ochie ha amịtaghị mkpụrụ. N'ofesi, The landslide was caused by heavy rains that have struck China this summer Ihe mberede mbuze na apịtị egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ ebe a ka na-achọ ihe ruru mmadụ iri na ise na mpaghara ndịda China. N'egwuregwu, Ndị Real Madrid akagbuola ọpụpụ Gareth Bale dịka ha ji ya mee ndị Jiangsu Suning dị na mba China akpịrị ogologo. Ha sị na ọ ka ga-anọchapụ maọbụ ndị Suning akwụọ ha ụgwọ mkpọfe a kpọrọ ""transfer fee"". Ebee a ka a ga-esu ya kpọm, bata n'ọgbakọ BBC Igbo.com anyị bụ ekwuchaa ọ gwụ na mgbasa ozi. Akụkọ na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Iheanacho achọtala ụkwụ o ji enye goolu ọzọ? Kelechi Iheanacho nyerekwara goolu abụọ mgbe Leicester City na Fleetwood sọrọmpi maka iko FA Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ dịka ndị otu bọọlụ ya bụ Leicester city na Rotherham United ji ọkpụ goolu abụọ abụọ laa n'ụbọchị Satọde. Cheta na oruola onwa iri Iheanacho nyesoro goolu mana ọ dị ka ukwu ya achọtala ebe ọnụ goolu nọ ọzọ. Boko Haram egbuola mmadu iri abụọ na atọ si akwamozu ala na Borno steeti. Ndị otu egbu-aṅụ-ọbara bụ Boko Haram egbuola mmadu iri abụọ na atọ na Borno steeti. Nke a mere dịka ndị a si akwamozu n'obodo Goni Abachari alahachị Badu Kuluwu mgbe ndị omekome a ji ọgbatumtum were wakpo ha. Ndị dinta na ndị nche bị na mpaghara ahụ kwuru na hụrụ ọzụ iri abụọ na atọ. N'Ofesi, Ndị uweojii na mba Rissia anwuchiela ihe karịrị otu puku mmadụ dịka ihe ruru puku iri abụọ mere ngagharị iwe. Ndị na-eme ngagharị iwe a sị na gọọmentị nọ n'ọchịchị ekweghị ka ndị otu ndọrọndorọ ọchịchị anọghị nọ ọchịchi weta ohere họpụta ndị ga-eburu ha ọkọlọtọ. Gee nkeji BBC ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 42696309,https://www.bbc.com/igbo/42696309,Lasa fiva: Ihe ị ga-eme were gbochie ya,Ọriị lasa fiva nke oke na-ebugharị egbuola mmadụ atọ n'Ebonyị steetị ụnyaa na taa.,"Oke ndi na-ebute lasa fiva ka nku na Naijiria Otu onye ọrụ ahụike bụ Dkta Azụọgụ Benedict kwuru nke a oge ọ gwara BBC Igbo okwu. Mmadụ atọ ahụ nwụrụ bụ ndị ọrụ ahụike na ụlọ ọgwụ ukwu dị na Abakaliki, Ebonyi steeti, mmadụ abụọ bụ dọkinta ebe otu onye bụ nọsụ nwoke. Dkta Azụọgụ gwara BBC na ha na-ele anya na ndị ahụ nwụrụ butere ọrịa ahụ site n'ahụ ndị ha na-eleta n'ụlọ ọgwụ. Dkta Azụọgụ kwuru: ""Ụfọdụ oge ndị dọkịnta na-achọ inyocha ndị ọrịa, ha agaghị ama ihe na-arịa ha ma ọ bụ ọrịa na-efe efe, ha na-esi etu a ebute ọrịa. ""Anyị ekwuola ka ndị dọkịnta na-emeo ọrịa niile omume ka lasa fiva ma kpuchie onwe ha nke ọma."" O nyere ndụmọdụ ka ndị na-ehicha ụlọọgwụ tinye uchu ma jiri ihe ndị na-egbu nje na-eme ka ụlọ ọgwụ na-adị ọcha oge niile. Mana o kwuru na ha nwere mmetụta na enweghi ezie ebe a na-akpoga ndị nwere lasa fiva N'aka nke ọzọ, o kwuru etu ndị mmadụ ga-esi gbochie ya bụ ọrịa lasa fiva. Ụzọ mgbochi lasa fiva Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:" afirika-52572023,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52572023,Coronavirus : A na-eke ihe 'palliative' hapụ ndị nọ na Ndịda Naijiria - Frank Nweke,Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaobi bụ Frank Nweke akpokuola gọọmenti etiti ka ha mee ndị ndida ihe e mere ndị Ugwu n'okike ihe enyemaka maka nsogbu ọrịa coronavirus.,"Nweke, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde sị na-emeghị onye ka e mere ibe ya n'okịke nri na ihe anyamaka gọọmenti etiti kere maka Covid-19. Ọ sị na e lere anya n'ihu na ike ihe mgbadoume ahụ dịka boro ebubo na ndị Ugwu ka rite elele ahụ karịa ndịda. ""Ile anya n'ihe mere , ebe a kpọchiri bụ ebe ọrịa ahụ batara na Legọs, Ogun na Abuja, mana e bidoro kewa ihe n'Ugwu ebe ekere mpopo ego n'abalị abụọ, hapụ ebe ihe metụtara kpọmkwem."" 2. Ịchụ n'ọrụ n'ihi coronavirus N'okwu nkụda akụnaụba nke mere ọtụtụ n'ụlọọrụ ji achọ ịchụ ndịọrụ, Nweke tụnyere alo ka ""Gọọmenti Naijiria kpọọ ọgbakọ nke ndị nweụlọrụ ka ha kpaa ụdị enyemaka ha chọrọ iji hụ na ha achụghị ndị ọrụ ha n'ihi coronavirus."" 3. 'Ọ dị mkpa ịtụ ndị ọzọ 'gap'' Nweke, onye sị na 'o nweghị ihe aga ere ndụ mmadụ agaghị ego ya' nyere ndị Igbo ndụmọdụ maka mgbochi coronavirus sị, "" A sị na ka ekwezighị n'aka, na anyị ga-atụ onwe anyị 'gap', ọ ga-aka mma.' ""Etu asị azụ ahịa. Azọtagodi ndụ, ekwuwezie etu a ga esi rie ndụ."" 4. Mmanụ agbidi na mwulite akụnaụba Naijiria ""Coronaviqrus biara akụnaụba anyị daa, abụghị izizi ọ na-eme. "" Anyị aṅụburuọ iyi na ọ bụghị sọ na mmanụ ka anyị ga-atụkwasị obi were na-achị obodo mana ihe mecha anyị alaghachi azụ.."" Nweke onye kwuru na Naijiria nwere ndị ntorobia, nwee ala, nwekwa nka dị iche iche ha kwesiri ilebanye isi nweta ego, hapụ ilekwasa anya na naanị mmanụ. ""Tupu nke a mee, anyị mara n'ihe gbasara mmanụ na-agbada sir=te n'okwu climate change' dịka e kwuru na ọ na-emebi ikuku nke na mmiri anaghị ezozi ka o si ezo, maọbụ mmiri ezowe n'oge ọkọchị."" "" Ihe anyị nwere ike ime n'ala anyị anyị nweziri ike ime ga."" N'okwu mpụ na-izu ego gọọmentị, Nweke sị na ""ihe a na-ezu adịghịzị, ọ ka mma ka ndị na-achị achị mere ndị mmadụ ebere."" Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka gọọmentị"" tinye uche na ihe ndị ndị mkpa maka iwulite obodo dịka ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na okporoụzọ. 5. Ndịiche dị na PDP na APC Nweke kwuru na APC anaghị anabata echiche si na ndị anọghị n'ọchịchị dịka PDP nke o kwuru nyere ndị mmadụ ohere ikwu uche. N'okwu ya tulee etu PDP na APC si eso ndị anọghị n'ọchịchị, Nweke sara sị, ""Ogoli lụọ dị abụọ, ọ mara nke ka mma."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46314759,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46314759,Odumegwu Ojukwu: 'Igbo agaghị echefu ya makana o nweghị onye ga-anọchinwu ya',"Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ otu onye Ndigbo agaghị echefu aha ya echefu, mana gịnị ka ị maghị maka ya?","N'ịcheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na ""Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-eme."" O kwuru na ọ bụrụ na ọ ka nọ ndụ ugbua, ọ ga na-ekwuru Ndigbo ọnụ ha dịka ọnọdụ Igbo dị ugbua na Naijiria. ""Enweghị onye dị ka Ojukwu, enweghị onye ga-anọchinwu ya"" - Uko Site n'oge Ojukwu bụ onye agha Naịjirịa bido n'afọ 1957 ruo 1967, ruo mgbe o hibere ma bụrụ onyeisi ndị agha Biafra bụ ndị na-achọ nnwereonwe ha n'ụbọchị Mee 30 nke afọ 1967, Ojukwu mere ihe ndị e ji kpụrụ ya n'ọnụ. Oge ọ ka nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị, a nwụchiri ya n'ụlọ mkpọrọ maka imenye otu onye nkuzi si Briten wakporo nwaanyị onyeisi ojii, ihere. Nna ya bụ Louis Odumegwu-Ojukwu, so na ndị ego ha bụ eriwe agwụ agwụ nke mere na oge Ojukwu dị naanị afọ 13, nna ya zigara akwụkwọ na mba Briten. Ihe i kwesịrị ịma maka Ojukwu: 'Ndị ibe anyị na-azọkwasa anyị ụkwụ n'isi' - Uko Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46578152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46578152,Ipob sị ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị a ga-eme ntuliaka nke 2019,Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agwala ndị otu ha niile ha nọrọ n'ụlọ mgbe a ga-eme ntuliaka nke 2019.,"Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Onye kwuru nke a bụ Ukochukwu Udochukwu Peace mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụtụtụ Satọde. Peace sị na ọ bụ ụzọ ha ga sị mee ka onye ọbụla kpọro ọnwe ya nwa Biafra ghara iso ga ya bụ ntuliaka n'afọ ọzọ. Ọ sị n'Ipob ekpebịelarị kemgbe na ha agaghị eso eme ntuliaka ahụ bụ nke ha sị na-onweghị isi. Rev. Peace Udechukwu bụ ọnụ na-ekwuru Ipob n'Abuja Na olụ ya, ""ị na-eme ihe ị na-eme kwa afọ anọ na-atụ anya ịnwete mpụtara dị iche, onwe gị ka ị na-aghọgbụ."" Ọ sị na ihe a bụ ụzọ ndị ọbụla na-ebu agha mnwere onwe ga-eso ka ụwa mara na ha kpọrọ ya ihe. Akụkọ ga-amasị gị" 42789180,https://www.bbc.com/igbo/42789180,Kedu ihe ofe Egusi gị na-enye ahụ gị?,Ofe egusi bụ otu ofe ndị Igbo na-ejighi egwu egwu.,"Egusi na-arịarị n'ahụ osisi nke na-etopụta n'ime elili Ndị Igbo na mpaghara etiti Sahara na-eri ya nke ukwu ma jiri ya eleta ndị ọbịa. A na-esikwa ya ebe a na-eme mmemme dịka ịgbankwụ, ikupụtanwa maọbụ ebe a na-akwa ozu. Ọ bụ ofe ndị Igbo ji eme ọnụ mana tupu ọ bụrụ ofe, ọ na-agafe ọnọdụ dị icheiche. Egusi na-amikarị ebe mmiri dị Egusi bụ mkpụrụ na-esi ike elili a na-ekpepụ okpokoro azụ ya tupu akwọọ ya maọbụ sie ya. Ọbụghị sọ ofe ka eji egusi esi, ụfọdụ ndị mmadụ na-eye ya eye a taa dịka ahụekere. Mana kedu ihe Egusi gị na-enye gị n'ahụ? Proteni (Protein) nke na-edozi anụ ahụ ruru ihe dịka pasenti 30 rue 40 Abuba (fat) rukwara ihe dịka pasenti 30 rue 40 Nri na-enye ike n'ahụ (Carbohydrate) ruru pasenti 10 Vitamin A, B1, B2, Ch na vitamin E, nke alfa-tokoferol so cha ihe no n'ime egusi. Alfa-tokoferol na-enyekwa aka ime ka ahụ mmadụ dịka ọ kabeghi ma na-enyekwa aka maka ọmụmụ nwa. Ihe dịka kalori 462 nọ n'ime otu efere ofe Egusi. Egusi bụ ofe a na-eji ụtara dị icheiche eri. E ji akpụ maọbụ ọka na nrị ndị ọzọ eri ofe egusi A na-ejiụtara akpu, ụtara ji, garrị, ụtara ọka, ụtara osikapa na ndị ọzọ eri ofe egusi. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ejikwa ofe egusi eri osikapa. Etu ọbụla ịchọrọ iri ya, racha aka gị nke ọma mgbe ị na-eri ofe egusi." 43085664,https://www.bbc.com/igbo/43085664,Dibia bekee: Kwụsịnụ iṅụ akpụrụachịa,Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ị ṅụrụ mmanya ọkụ karịa otu karama ka ị ga-adaba na nsogbu.,"Mmanya akpụrụachịa alala ọtụtụ ntorobia n'iyi Mana ndị dibia bekee ekwuola na o nwere mmanya ọkụ na-ekwesịghị ịba mmadụ ọnụ. Ufọdụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na aha a na-enye mmanya ọkụ a na-ere n'akụkụ ụzọ akpọrọ akụrụ akụ n'atọ ọchị. Ha gụnyere akpụrụachịa, energy 2000, kerewa, fonofiri, kparaga, ogidiga, Ibile, baby ọkụ, Kogbebe, monkey shoulder, koboko, dadubule, apoko, gallant, pasa bitters, osomo, orimalu, nakwa durosoke. Ọ pụtara na mmanya ọkụ adighị mma? Otu dibia bekee akpọrọ Darlington Akahara, gwara BBC Igbo na mmanya ọkụ nwere oke ga abụ ị ṅụọ ya o dozie ahụ, oke ahụ bụ pasentị abụọ na ọkara. Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ gbaara ụmụ mmanya ọkụ akpọrọ akpụrụachịa ọsọ, maka na ngwongwo dị na ya na-egbu umeji anụ. Ọ kọwara ihe kpatara akpụrụachia ji dị njọ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a. Dibia oyibo kọwapụtara maka mmanya ọkụ na otu osi dị njọ Otu ihe si kwuru ụgbụa, ọ dị oke mkpa ka ndị isi oche leba anya na mgbalite mmanya ike nke gazugoro ala Naijirịa. Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ akpọrọ NAFDAC ekwuola na pasentị iri asatọ mmanya ọkụ eji ahihia mepụta adịghị nma n'ahụ maka na ọ na-eripiasị ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ." afirika-45322735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45322735,Afọ a na-achọzị ịsagbu ndị mmadụ na Borno?,Ụlọọgwụ niile na-agba ghara ghara ugbua maka ọrịa afọ ọsịsa nke tipuru na Borno steeti.,"Afọọsịsa nwere ike igbu ụmụaka pii Akụkọ na-akọ na ihe ruru mmadụ 1,068 na-azọ ndụ ha ka ọ dị ugbua. Kọmịshọna na ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Haruna Mshelia kwuru na ya bụ ọrịa agbasala okpuru ọchịchị gọọmenti iri na steeti ahụ. N'ime ndị niile ọrịa metụtara, ọ sị na mmadụ 25 nọ n'ụlọọgwụ Benisheikh, Dala na ọzọ akpọrọ El-Miskin. Kọmishona Mshelia gbaara ama a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ụrụ ọbara ị dị ọcha nakwa igbochi ụmụ nje na-ebụ ọrịa nọ na mmiri. Ọ sị na ihe nwere ike ibute ya bụ afọsịsa ebe niile ""bụ ị ga mposi ebe ekwesighi ya na gburugburu mmadụ adịghị ọcha ka o sị kwesi, ọkachasị n'ogige ebe ndị gbara ọsọ ndụ"". Ọ sị na ""mgbasa ozi maka ịdị ọcha na gburugburu ebe mmadụ bi bụ isi na-ịkwụsị mgbasa ọrịa a"" bụ nke tara isi mmadụ 61 n'afọ gara aga. Ọ sịkwa na onwebeghị onye nwuru site na ya bụ ọrịa ka ọ dị ụgbụa mana naanị otu onye nwugoro n'ime ihe kariri mmadụ nari ọrịa ahụ bituru aka kemgbe afọ a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47521146,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47521146,Emeka Ihedioha: 'Ya nyere anyị aka butuo ụgwọisi ụmụnwaanyị Mbaise',Emeka Ihedioha bụ onye meriri na ntụliaka nke ọkwa gọvanọ emere n'Imo steeti ekwuola ọtụtụ ihe ọ ga-emere ndị Imo.,"Emeka Ihedioha: M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti Otu n'ime ihe o kwuru na ọ ga-eme bụ imezi ihe mebiri emebi na steeti ahụ. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru n'ihe nkiri a. Ka ndị mmadụ ka na-enwe aṅụrị maka mmeri Emeka Ihedioha meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti, ndị ọzọ ekwuola ihe ha chọrọ n'aka ya. Ebe ụfọdụ na-achọ ka ọ rụọ ụzọ, ụlọọgwụ na ihe ndị ọzo, ụfọdụ chọkwara ka ọ kụtuo akpụrakpụ Rochas Okorocha rụrụ. @JerryWright4 dere na Twitter sị ka Ihedioha lebanye anya n'ihe gbasara ibutu ụgwọisi ụmụnwaanyị Mbaise, maọbụ ka gọọmentị nyeretu ha aka ịkwụ ya bụ ụgwọ mgbe ha chọrọ ịlụ nwaanyị. Emeka Ihedioha kwere ndị Imo steeti nkwa na ọ gaghị awụ ha n'ala dịka ha si n'aka ntuliaka họpụta ya dịka onye ha chọrọ ka ha chịa. O kwuru nke a site n'ihe o dere n'elu soshal midia, ebe o dere sị ""Ndị Imo daalụ. Mmeri a bụ nke anyị niile! Agaghị m awụ unu n'ala! Okwu m bụ nkwa m na-ekwe!"" Cheta na Ihedioha nwetara vootu 273,404 iji merie ndị ọzọ ya na ha so zọo ọkwa. Ihe ndị mmadụ chọrọ n'aka ya: Charly boy si Imo steeti ma bụrụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, kwuru sị na ọ na-atụ anya na ọchịchị Ihedioha ga-abụ olileanya nye ndị Imo. Ọ sịkwa ya ""kwanyere onwe gị ugwu"". @MrStanleyNwabia kwuru na ihe mbụ Ihedioha kwesịrị ime ma ọ banye ọchịchị bụ ibugharị akpụrakpụ niile ahụ Rochas Okorocha kpụrụ, buga ya n'obodo Rochas. @DuruchibuzorE kwuru na ugbua ka ọ ga na-alaruzi obodo ya makana Imo steeti esila n'aka ""ndị na-akpụ"" ihe pụta. @DaChinagorom rịọrọ ya sị ya gbaa mbọ hụ na o mere ka Imo steeti bụrụ ebe a na-arụpụta ihe dịka Abịa na Anambara. @iamLORDTM kwuru sị na ọ dị mma na a napụtara ọchịchị n'aka onye chọrọ ime ka ọ dịrị naanị n'ezinaụlọ ya. @kingpado01 kwuru sị ka ọ gbaghachaa ala ndị ""e zuru ezu"". @Buchyogba kwuru sị ya gbaa mbọ rụgharịa ụzọ ndị adịghị mma, kwụọ ndị ọrụ bekee e ji ụgwọ ọnwa, ma nyochaa ọchịchị Rochas. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50313831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50313831,Ovuleria nwunye Zebrudaya: A ka dị m ndụ,Lizzy Evueme bụ onye e ji Ovuleria Urediya Nwaogbo mara sị na ọ ka dị ndụ na ọ nwụghị anwụ.,"Ovuleria Urediya: Chineke akpọbeghi m Mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti ị mata nke bụ eziokwu, ọ sị na ọ ka dị ndụ ma nweekwa ahụike. N'okwu ya ""Adị m ndụ , nwee ahụike. Chineke akpọbeghị m, a mara m na m ga-anwụ mana ọ bụghị ma Chineke a kpọbeghi m"". Lizzy sị na o nweghi ọrụ ọ na-arụ ugbua, na ọ bụ ụmụ ya na-azụ ya nakwa elekọta ya anya. Cheta na akụkọ malitere ifegharị na soshial midia kamgbe ụnyaahụ na 'Ovuleria Urediya' anwụọla. Akụkọ ọzọ pụtara taa bụ na Ụlọikpe mkpegharị enyela Biodun Olujimi nke PDP mmeri dịka ọ gbara Senetọ Dayo Adeyeye nke APC akwụkwọ na ya ekweghị na mkpebi Inec na ntuliaka ha mere. Cheta na Ụlọikpe napụrụ ndị APC ara n'ọnụ dịka ha enyere Ifeanyi Uba na Obinna Chiduka bụ ndị mmeri na Anambra steeti. Boris Johnson agbaala afa Brexit Kedụ nke na-akpọtụ maka Brexit? Nke na-eme ebe ahụ bụ na Onyeisi mba ahụ bụ Boris Johnson sị na ọ bụrụ na ya merie ntuliaka ha ga-eme na Disemba na ya ga-akpọpụta Briten na EU na Jenuwarị. Ka ọ na ekwu nke a, otu onye na pati ha bụ Alun Cairns agbaala arụkwaghị na ya bụ pati. Nicole Adams alaala ezuike N'egwuregwu, nwaagboghọ na-akụrụ mba Briten ọkpọ bụ Nicola Adams bụ nke ji ọlaedo abụọ nke ogogo Olympic sị na ya ga ala ezumike n'afọ 37. Ọ sị na-egwu ịkụpịa ya anya ji ya dịka ọ na-ekele ndị niile kwadoro ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ụbọelu Airpeace lọghachịrị azụ na njem ya Otu Ụgbọelu Air Peace kwesiri ịsi Legọs fega Owerre emeela ntụgharị gbatagbata. Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Air Peace bụ Stanley Olisa kwuru na ụgbọelụ ahụ efenyiela tupu ọkwọ ụgbọelụ achọpụta na otu injin ya nwere nsogbu ma tụgharịa feghachi Legọs. Ọzọ, Femi Falana Otu ụlọikpe na Legọs enyela iwu ka ndị agha Naịjirịa kwụsị atụmatụ ha kpọrọ Operation Positive Identification. Onye ọkaiwu ukwu bụ Femi Falana bụ onye gbara ndị agha akwụkwọ kọwara na atụmatụ ahụ megidere iwu kpuchiri ọchịchị Naịjirịa. Na mba ofesi, Gọọmentị Zimbabwe achụọla dọkịta karịrị iri asaa n'ihi isonye na ngagharịwe ndị dọkịta na-eme kemgbe ọnwa sepụtemba maka ụgwọ ọnwa. Ndị dọkịta kwụdosiri ike na-eme ngagharịwe n'agbanyeghị na n'ọnwa ọktoba, otu ụlọikpe kpebiri na ngagharị iwe ahụ dara iwu N'egwuregwu, Ugo obere Naịjirịa adapụla na njem ịbụlata iko mbaụwa afọ 2019 nke ndị obere, dịka mba Netherlands ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie ha n'ụtụtụ Wenzde. Olakunle Olusegun bụ onye nyere otu goolu Naịjirịa na ya bụ asọmpị." egwuregwu-43723467,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43723467,Asọmpi Commonwealth: Ndị Kamerun 8 ahapụla ndị otu ha,Ndị ọrụ gọọmenti Cameroon ekwuola na mmadụ asatọ n'ime iri abụọ na anọ ha kpọ gaa asọmpi egwuregwu Commonwealth n'Australia efuola n'ebe obibi ha.,"Ndị ọrụ Kamerun kwuru na Arcangeline Fouodji Sonkbou bụ onye na-ebuli igwe so na ndị egwuregwu na-efu Onye ntaakụkọ so otu Cameroon bụ Simon Molombe gwara ndị ọrụ BBC na ha na-eche na ọ bụ 'mgbaghapụ ka ha mere', ma kwuokwa na ha ekpesala ofufu ha n'aka ndị uweojii Australia. Molombe kwuru na anya ikpeazụ a hụrụ mmadụ atọ ndị na-ebuli igwe bụ n'ụbọchị mọnde, ebe ndị na-akụ ọkpọ ise milara na tuusde. ""Ndị egwuregwu a pụrụ n'usoro atọ - mmadụ atọ bu ụzọ pụọ n'abalị Epreelụ 8. Achọwakwara mmadụ abụọ ọzọ n'ụbọchị 9, ebe mmadụ atọ hapụrụ imeụlọ ha n'abalị ụnyaahụ."" ""Mmadụ atọ ndị na-ebuli igwe na ndị na-akụ ọkpọ ise ahụ so n'otu nwere ọzụzụ n'ogige dị na Warwick tupu anyị agawa Gold Coast. Mana ebe a, naanị isii n'ime ha sonyere n'asọmpi ha, ebe abụọ pụrụ na-asọghị mpi ọbụla."" ""Ndị ọrụ otu Cameroon agwala ndị uweojii Australia ihe na-aga nakwa ndị ọrụ ha nọ na Kamerun."" Akụkọ ndị ga-amasị gị Ndị Cameroon kwuru na otu ha nwere akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ nke bekee kpọrọ visa, ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Mee. Edepụtara aha ndị egwuregwu a na-efu - Olivier Matam Matam, Arcangeline Fouodji Sonkbou na Petit Minkoumba bụ ndị na-ebuli igwe, ebe Christian Ndzie Tsoye, Simplice Fotsala, Arsene Fokou, Ulrich Yombo na Christelle Ndiang bụ ndị na-akụ ọkpọ. Molombe kwuru ""Ihe ndị a gbara ọsọ mere wutekwara ndị isi - ụfọdụ esoghịdị sọọ mpi"" ""Ekpere olileanya anyị bụ na ha ga-alọghachite nwee ike soro ndị ọzọ laghachị Cameroon.""" media-43237581,https://www.bbc.com/igbo/media-43237581,Ịchịgharị ehi: Ndigbo asaala onyeisi ndị uweojii,Ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọla ọnọdụ onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nyere a ga-eji kwụsị nsogbu dị n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo sị na ọ bụ okwu ịchọ okwu.,"Unyaahụ, Idris gwara ndị gọọmenti steeti ka ha bụrụ ụzọ mapụta ala maka ọdọ ehi tupu ha amabido ịchịgharị ehi. Onye chịburu dịka onyeisi otu Aka Ikenga bụ Goddy Uwazuruike gwara onye ntaakụkọ BBC na okwu onyeisi uweojii kwuru bụ okwu ịchọ okwu. ""Onyeisi ndị uwe ojii ekwuteghi ọfụma. O kwughị okwu ka onye nọ na nnụkwụ ọkwa."" Uwazuruike kwuru sị, ""Ọ bụ steeti bụ ndị nwere ikike maka ala. Ihe ọbụla ha kwuru maka ala bụ ihe ga-eme. Ị bịa na-agbara ndị na-achị ehi, ihe ọ masịrị ha mee, onweghị ihe ga-enye ha ikike ịga n'ugbo mmadụ ebe mmadụ kọrọ akpụ, ji na ede ịga mebie ya. O kwuteghị ya. Ihe ọ na-ekwu bụ okwu e ji achọ okwu."" Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisi ndị uweojii kwesịrị ịkwụsi ike na onye na-achị ehi mebiri ihe onye ugbo kwụ ụgwọ ihe o mebiri. ""Ihe o kwesiri ikwu bụ na onye na-achị ehi na anụ ndị ọzọ agakwala ebe ahụ. I bịa, dowe iwu obodo ahụ, ịda iwu ha, ha ga-ahakwa gị nha. Ọ bụ ihe ejiri mara onye eziokwu. Onye bụ onye eziokwu agaghị na-agba okwu okirikiri."" Ọ sịkwara, ""Ị gaghị abịa na Enugwu na-atụrụ ndị Enugwu etu ha ga-ezi mee ala ha. Ichọ Izu ala ga-zuru ala. Ichọ ime ya ọgba ebe a na-azụ ehi, o nwere onye ga-akwusi gị? Obodo ọbụla. I ga Imo steeti, I mekwa otu ihe ahụ."" Onye osote onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ NBA n'aha ịchafụ bụ Barr. Monday Ubani kwụnyere Uwazurike n'ihe o kwuru. N'okwu ya, ọ siri: ""O nweghi iwu e nwere nke na-ekwu na ọ bụ iwu ịwapụta ọdọ ehi na steetị. Ebe ọ bụ na-onweghi, ọ bụ ihe dị mgbagwoju anya, dịkwa njọ na onyeisi ndị uweojii ga-amabido ndị steetị inwe iwu megide ịchịgharị ehi. Eleba anya n'iwu ala anyị, o nweghi ike a. Ọ bụ sọọsọ ụlọikpe nwere ikwu na iwu emegidere iwu Naịjirịa."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Okacharamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Emeka Monye kwuru na ọ bụghị ọrụ dịrị onyeisi uweojii ikwu ihe ha ga-eji ala mee. Dika Monye siri kwuo, ""Ọ bụ okwu dịrị ndị gọvanọ na ọgbakọ ndị omeiwu nke steeti na nke gọọmenti etiti ikwu ihe gbasara ala ha. Okwu onyeisi uweojii bụ okwu aghụghọ. ọ dighị mkpa inwe ọgba ebe ana-azụ ehị tupu ị nwuchie ọnye na-achịgharị ehi."" O kwukwara n'ihe ndị uweojii kwesiri ịme bụ nyocha site na-ịnụta kepukepu etu na ebe ndị na-achị ehi na-akwado mkpamkpa." afirika-52494527,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52494527,Owerri Building Collapse: E jighi ngwaọrụ dị mma rụọ ụlọ ahụ dara ada - Gọọmentị Imo steeti,"Mmadụ anọ anwụọla, ebe ọtụtụ mmadụ ka tọrọ n'ime ụlọ ogo asatọ nke dara n'Owere n'ụbọchị Tọzde.","Ndị mmadụ gbatara n'oge ịzọpụta ndị ụlọ ahụ dagidere Nke a bụ dịka ndị ọrụ gbata gbata na-agba lịka lịka ịzọpụta ndị mmadụ. Ihe ruru mmadụ 12 bụ ndị azọpụtara ma kpọrọ ha gawa ụlọọgwụ FMC Owere. Onyeisi ngalaba 'Owerri Capital Development Authority' bụ Innocent Ikpemezie kwuru na ndị ọrụ ha ka na-agba mbọ ịhụ na a zọpụtara ndị niile ka nọ n'ime ụlọ ahụ. Gere ihe o kwuru ebe a: E jighi akụrụngwa dị mma rụọ ụlọ ahụ dara ada n'Owere - OCDA N'aka nke ọzọ, kọmishọna na-ahụ maka ala n'Imo steeti bụ Eyinna Onuegbu kwuru na ha ga-ehibe kọmiti ga-eleba anya n'ihe ahụ mere. Ụlọelu ogo asatọ a nke bụ 'eight-storey' na bekee dara na mpaghara New Owerri, n'okporo ụzọ Musa Yar'Adua Drive. Ebe ya bụ ihe mere dị nso n'ụlọọrụ ntaakụkọ Hot Fm nke dị n'Owere. Akụkọ kwuru na ụlọelu ahụ bụ ụlọ oriri na nkwari a ka na-arụ arụ. Ọtụtụ ndị ọrụ juru na ụlọ ahụ na-arụ ọrụ oge ya bụ ụlọ dara. Ndị ngalaba gọọmentị Imo steeti a kpọrọ 'Owerri Capital Development Authority' mechara gbata ịma nke na-emenụ. Ndị nọ oge ihe a mere na-ekwu na ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ oge ọ dara ruru mmadụ 50. Ndị uweojii gbatakwara ọsọ enyemaka n'egbughị oge. N'ihi enyemaka ndị mmadụ, a zọpụtara ọtụtụ ndị nọ n'ime ụlọ ahụ oge ọ dara. O dobeghi anya mmadụ ole a zọpụtara n'ihe mberede a nakwa mmadụ ole ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ dara ada. Mana onye ntaakụkọ gara ebe ahụ kwuru na ya hụrụ mmadụ 17 a zọpụtara. O kwukwara na ya hụrụ ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ mana ọ maghị mmadu ole ha dị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44219318,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44219318,Nwoke egbuola nwunye ya maka ekworo,"Otu ojiegoachụego a kpọrọ Tochukwu Chukwu, onye Uli na Anambara Steeti, egbuola nwunye ya n' Oshodi, Legos maka ebubo ịgba n'ilo.","Na nso nso ndị anwụchiela maka igbu dị ha maọbụ nwunye ha na-arị elu Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti gwara onye ntaakụkọ BBC na aka kpara nwa amadị ahụ oge ọ gara ịtụfu ozu nwaanyị a nke ọ sụnyere na bọket n'ụzọ ụtụtụ. Oge ndị agbataobi jụrụ ya ihe o bu n'isi ma o nweghị ezi nkọwa o nyere ha, mere ka ha manye ya ka o mepe ya. Ha were hụ ozu nwaanyi o jiri akwa gbuchie ma kụwa ya ihe mecha were ya nyefe ndị uweojii. Oti kọwara na nchọpụta nke onyeisi uweojii nke ogige ndị uweojii, Akinpelu Police Station kwuru merela na-egosi na ọ bụ nsogbu ezinaụlọ. Okwukwara na ndị uweojii jichiri nwoke ahụ ganye na ha mechaa nyocha zuru oke, ebe ka tinyekwara ozu nwunye ya n'ụlọozu maka nchọpụta. Imohimi Edgal,Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti agbala ndị omekome ka ha chọrọ ezigbo ọrụ ruwa maọbụ kwarapụọ na steeti ahụ. Ndị mara nwoke ahụ ebe ọ na-azụ ahịa n'ahịa Ladipo dịkwa na Legos, kwuru na ọ bụ ekworo mere nwoke jiri gbuo nwunye ya. Otu onye a chọghị ka a kpọ aha ya kwara BBC na nwoke ahụ bụ onye gabuola mkpọrọ afọ ise ma bụrụkwa onye na-aṅụ anwụrụike. Akụkọ kọro na nwoke ahụ gara njem ma kpọ nwunye ya na ekwenti, olu nwoke azaa ya nke mere ka ya na ya lụwa ọgụ. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-45375442,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45375442,Uefa Europa League: Ị ma ndị Chelsea na Arsenal ga-ezute n'asọmpi a?,"Otu Arsenal na Chelsea enweteghị ohere ịgba n'asọmpi Champions League nke afọ a, mana ha ga-agba mbọ ịhụ na awụghị ha n'ala n'asọmpi a n'afọ a.","Chelsea buliri iko a n'afọ 2012/2013 ga-agba mbọ ịhụ ma ha a ga-eru agba ngwụcha nke a ga-agba na Baku bụ isiobodo Azerbaịjan, n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2019. Otu egwuregwu ndị si Spen ebuliela iko a ugboro ise n'ime afọ asaa garala aga (Sevilla buliri ya ugboro atọ site na 2014 ruo 2016 oge Unai Emery na-achịkọta Arsenal ugbua bụ onye nchịkọta ha). Ndị ga-ezute ibe N'otu A Bayer Leverkusen Ludogorets Razgrad FC Zurich AEK Larnaca N'otu B Salzburg Celtic RB Leipzig Rosenborg N'otu C Zenit St Petersburg FC Copenhagen Bordeaux Slavia Prague N'otu D Anderlecht Fenerbahce Dinamo Zagreb Spartak Trnava N'otu E ARSENAL Sporting Lisbon Qarabag Vorskla Poltava N'otu F Olympiakos AC Milan Real Betis Dudelange N'otu G Villarreal Rapid Vienna Spartak Moscow Rangers N'otu H Lazio Marseille Eintracht Frankfurt Apollon Limassol N'otu I Besiktas KRC Genk Malmo Sarpsborg N'otu J Sevilla Krasnodar Standard Liege Akhisar Belediyespor N'otu K Dynamo Kiev Astana Rennes Jablonec N'otu L CHELSEA PAOK Saloniki BATE Borisov Vidi Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43679588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43679588,Ihe a na-ekwu gbasara Aisha Wakil na 'social media',Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na Aisha Wakil bụ onye Igbo a na-alụ na Kanuri.,"Aisha Wakil kwuru na Bokoharam ga-atọghapu nwa Dapchi akpọrọ Leah Sharibu Isi sekpu ntị kita bụ na ọ gbara ndị Igbo gharị ka ya ndị Boko haram si akpakọrịta ụka. Kamgbe ọ kọwachara BBC Igbo n'asụsụ Igbo ka ya na ndị oyiegwu a sị akpa, ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu uche ha n'igwe okwu 'social media'. Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo Ufọdụ na-akatọ mkparita ụka Aisha Wakil na Boko haram ebe ụfọdụ ka na-agbagha na ọ bụghị eziokwu na ya bụ nwaanyị suru Igbo. Lee ụfọdụ ihe ndị Igbo na-ekwu n'igwe okwu 'Facebook'. Ọ gbagwojuru ụfọdụ anya na Aisha Wakil bụ onye Igbo Ụfọdụ n'ime ha ekweteghị na Aisha Wakil bu onye Igbo. Ndị a ekweteghị na Aisha bụ onye Igbo Ọtụtụ ndị ụlọọrụ mgbasa ozi dị iche iche zisara ya bụ mkparịtaụka Aisha Wakil na BBC igbo nwere n'igwe okwu 'Social media' Ndị agha Naijiria sị na ha enweghi okwu ha ga-asa Aisha Wakil O bụghị taa ka Aisha Wakil bidoro kwuwe na ya na Bokoharam na-akparita ụka Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-53415176,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53415176,Fahim Saleh: Ihe ndị uweojii kwuru maka ọnwụ onye nwe Gokada,Akụkọ na-ekwu na Fahim Saleh bụ onye malitere ụlọọrụ 'Gokada' bụ ọgbatumtum na-ebugharị ndị mmadụ na ngwa ahịa na Naịjirịa anwụọla.,"Ozi a nke na-ewu ebe niile kọwara na ndị uweojii obodo New York chọpụtara ozu nwoke a mgbe nwanne ya nwaanyị chọrọ ya gawa n'ụlọ ya were hụ ozu ya. A hụrụ ebe ebepụrụ ya isi na aka nakwa ụkwụ nakwa na mma latrịk eji bọkasịa ya ka dị na be ya ebe a chọtara ya. Mana ndị uweojii NYPD gwara BBC n'ozi email na ha zara oku gbatagbata n'ehihie ụbọchị Tuzde ebe ha chọtara nwoke nwụrụ anwụ. Lee ozi ndị Gokda dere n'akara Twitter maka ọnwụ Fahim Saleh: Ha kwukwara na ndị ọrụ ahụike bịara ebe ahụ ma kwuo na nwoke ahụ nwụrụ n'ezie. ""Onyeisi ọrụ ahụike na-enyocha ya ahụ ịchọopụta ihe gburu ya mana nyocha nke ndị uweojii na-aga ihu"" ka ozi ahụ kwuru. Ha akpọpụtabeghị aha onye ahụ nwụrụ anwụ ganye mgbe a ga-ezi ezinaụlọ ya ọfụma. Ihe anyị ma maka Fahim Saleh Fahim Saleh bụ oji ego achụ ego nke bekee kpọrọ 'Venture Capitalist' gbapere Gokada na-ebu mmadụ na ngwa ọrụ na Naịjirịa nakwa Indoneshia. Cheta na gọọmentị Legọs steeti machiri ụlọọrụ ya na nke ndị ọzọ n'ọnbwa Febụwarị n'afọ a. Lee ihe o kwuru mgbe nke ahụ mere: A mụrụ ya na mba Saudi Arabia mana ezinaụlọ ya mechara kwara gaa na mba Amerịka ebe ha ka bi rue ugbua. Ọ gụrụ akwụkwọ na Bentley University dị na Massachussets na mba Amerịka. O nwere ụmụ nwanne nwaanyị abụọ bụ Rif Saleh na Ruby Bashir." afirika-49541413,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49541413,Pope Francis: Onyeisi ụka fada tọrọ na liftu,Pope Francis tọrọ na liftu n'ụtụtụ a mgbe ọ na-aga ụka ụtụtụ Sọnde.,"Pope agbalahụla ọdachị n'ụtụtụ Sọnde Ọtụtụ mmadụ na-akatọ Pope Francis maka mmgbanwe ọwetere n'ụka Ọ tọrọ ebe ahụ ihe ruru nkeji iri abụọ na ise bụ mgbe ndị ọrụ gbanụgbanụ ịmenyụ ọkụ bịara zọtụta ya ebe ahụ. Nke a mere ka Pope ghara ị ga ụka n'oge nke mere na-ọrịrịọ ndị bịara ụka mgbaghara maka nke a, ma kelekwa ndị ọrụ mgbanụgbanụ ahụ n'ụzọ pụrụiche maka ị gbakwụte ya mgbe ahụ. Pope rịọkwara ndị ụka ka ha kelekwa ndị ọrụ ahụ zọpụtara ya na ya bụ liftu o ji agbada na St. Peter's Square maka Anjelusu ụtụtụ. Akụkọ ndị Bloomberg buru na ọkụ latrik tabiri anya mgbe ya bụ liftu ji nwụọ ọkụ n'ụzọ. SERAP agbaala ndị omeiwu akwụkwọ Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Ndị otu kwụụrụ onwe ha bụ SERAP, BudgIT, Enough is Enough nakwa ndị mmadụ karịrị puku isii agbaala ụlọomeiwu etiti akwụkwọ maka akatamkpo ego ha mapụtara iji goo ụgbọala ọhụrụ. Ha na-arịọ ụlọikpe ukwu dị n'Ikoyi Legọs ka ọkwela ha jiri ego karịrị ijeri Naịra ise goo ụgbụọla bụ nke ha sị na omegidere iwu ala Naịjirịa. Maka ọrụ ndị uweojii ga-ewe Ndí uweojii Naíjiría akwadola ílúsa ndí Omeketereihepúújó agha Ndị uweojii ekwusiela ike na ha ga-akwụwa aka ọtọ mgbe ha ga-ewe ọrụ ha sị na ha ga-ewe mgbe adịghị anya. Onye na ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ bụ Ikechukwu Ani kwere nkwa ụbọchị ụka n'Abuja. Iwobi ejirila iwe mapụta ihuọgụ N'egwurewgwu, Nwafọ Igbo bụ Alex Iwobi nyere otu goolu na goolu atọ Evaton ji merie Wolverhampton Wanderers bụ ndị satara abụọ n'ime ha na asọmpi Premier Lig nke Sọnde. Nke a bụ goolu abụọ Iwobi na-enye n'izu ụka a. Nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọdachi na Texas Ihe ruru mmadụ ise anwụọla ebe ihe ruru iri abụọ merụrụ ahụ dịka otu nwoke bu egbe na-agba ndị ọkwọ ụgbọala na ndị ji ụkwụ aga n'obodo Texas dị na mba Amerịka. Isi nwoke ahụ lakwara na ya bụ ihe dịka ndị uweojii gbaturu ya oge o rutere na sịnịma ebe o bu n'obi imere na-aga. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu. Buhari alọtala Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachitela Naịjirịa dịka nzukọ kpọgara ya na mba Japan bịara n'isi njedebe. Ọ batara n'abalị ụbọchị 31 nke Ọgọstụ. Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ amachiela ịchị ehi agagharị Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Ndị Gọvanọ steeti niile dị n'Ọwụwa Anyanwụ enweela nkwekọrịta imachi ngagharị ndị ọchiehi, ọkachasị ndị nke na-ebu egbe na mma, na steeti ha. Ha mere mkpebi a na nzukọ pụrụiche ha nwere n'Enugwu ụnyaahụ, ebe ha nọ kwuo na ndị nchekwa steeti ha niile ga-eso hibe iwu a. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ amachiela ịchị ehi agagharị N'egwuregwu, Nwaafọ Igbo bụ Eze Joy Ogbonne, esonyela na ndị Naịjirịa ji aba n'ihe gbasara egwuregwu. Ogbonne dị naanị afọ iri na ise so na ndị Igbo atọ nwetara ihe nrite ọlaedo site n'ibuli igwe e ji akpụ ụzụ, n'asọmpi African Games bịara n'isi njedebe na Moroko ụnyaahụ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka." afirika-52927441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52927441,Child Abuse: Ihe mere mmetọ ụmụaka ụmụnwọke ji arị elu,"Dịka mwakpo ụmụnwaayị bụ akụkọ a kpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa, ọ dịkwa mkpa na e tinyere anya na mwakpo ụmụnwoke ọkachasị ụmụaka.","Ugboro ole na ole ka akụkọ mwakpọ na mmetọ ụmụaka ụmụnwoke na-apụta mana a naghị etinyechara ya anya dịka ọ dị na nke ụmụnwaanyị. Nke a mere anyị ji sị ka e lebanye n'ụfọdụ ihe na-ebu nke a, ihe ndị mere o ji arị elu, ihe nne na nna kwesịrị ime gdz. Chimezie Elekwachi bụ onye nchịkọta ọrụ n'ụlọọrụ na-ebuagha megide mwakpo ụmụaka a kpọrọ 'African Network for Prevention and Protection of Child Abuse and Neglect' nyere aka n'ịsa ajụjụ ndị a. O kwuru na-abịa n'ime mkpesa mwakpo ụmụaka ise batara n'ụlọọrụ ha na otu n'ime ha bụ nke metụtara ụmụnwoke. Ihe ndị na-ebute mmetọ ụmụaka ụmụnwoke Chimezie Elekwachi sị na e nwere ọtụtụ ihe na-ebute mwakpo na mmetọ ụmụaka bụ ndị gụnyere; Ọ sị na otu ihe na-ebutekatị ya bụ ihe a mụtara a mụta, na nwata e metọrọ mgbe ọ dị obere ga-achọ imetọ nwata ọzọ ma ọ bụrụ na o too. O kwuru na ndị ọkachamara kọwara na ụfọdụ na-amụta ụdị agwa a n'onwe ha dịka ha na-etolite a kpọrọ 'Developmental homosexuality'. Ụmụaka ndị ga-ebido na-amụ ya n'etiti ụmụaka ibe ha, si zie ebe ahụ mere na-aga n'ihu. Gịnị mere o ji arị ibe ya elu? Elekwachi sị na ihe mere akụkọ ịwakpo ụmụaka ji arị ibe ya elu ugbua bụ maka ịntanet nke nyere aka n'iji agbasa ozi n'ụwa. Nke bụ na onye pụta kwuo nke ya n'ịntanet, ndị ọzọ ewere ohere ahụ pụta kwuo nke ha, akụkọ a na-agbasa. O sị na mwakpo na mmetọ ụmụaka bụ ihe na-eme kamgbe gboo mana o nweghi etu e si ekwupụta ya. Kedụ ọrụ dịrị nne na nna banyere nke a? Elekwachi sị nne na nna kwesịrị ịṅa ntị n'ụfọdụ okwu ụmụaka ha na-akwa ha, na mgbe ụfọdụ na ọ bụ ihe banyere onye metọrọ ha. Na ha kwesiri iji nka chọpụta nke ọjọọ ma na-enyocha ahụ ụmụaka ha kwa mgbe kwa mgbe, iji chọpụta ma o nwere ihe dị iche n'ahụ ha. Ọ gara n'ihu kwuo na ha chọpụta na a wakporo nwa ha, ka ha akatọla nwa ahụ, a mala ya ikpe maọbụ taa ya ụta. Kama ka ha jiri nwayọọ kwado nwata ahụ site n'iti ya aka n'obi, ikpesara ndị uweojii maọbụ ụlọikpe. Ọzọ bụrụ na ha ga-akuziri nwata ahụ ụfọdụ ihe ndị a, ihe ọ pụtara, ọghọm dị na ya, mee ka ha mata na ọ bụ ihe ọjọọ. Nke ka nke bụ ka nne na nna gwa nwata ahụ ka ọ kpọọ aha onye ọbụla meturu ya n'ebe nakwa n'ụzọ na-adịghị mma." afirika-47419336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47419336,Hacking: Nwa obere nwa ji 'nka kọpụta nweta otu nde dọla n'ụzọ ziri ezi,"Otu nwa Argentina bidoro eme 'hacking' ka egwuregwu afọ atọ, na-enweghị ọzụzụ ọbụla- o nwetala dọla 1.1m site ịchọpụta mkpachi dị n'ụlọ ọrụ ọkainbe dị na mba ụwa.","Santiago Lopez akpatala nnukwu ego site na nka 'hacking' nke ó na-eme n'úzó iwu amabidoghí Santiago Lopez azụrọla onwe ya ụgbọala abụọ, nnukwụ ụlọ kara aka n'akụkụ mmiri nakwa elekere aka ọkaibe site na ego ọ na-enweta dịka 'ọchụnta ọgbataụhịe kọmpụta'. ""Ebidoro m ji nka kọmpụta akpa ego ka m lelechara ihe nkiri a kpọrọ 'Hackers.' Ihe ihazi 'code' na-acha ndụ ndụ masịrị m nke mere ka m bido mụwa ihe gbasara ya n'ụzọ nwere ike iji ya kpa ego n'ụzọ emegideghị iwu."" Santi kwuru na ya chọrọ igosi ụwa na ndị ọkaibe na iji nka kọpụta eme ihe masịrị ha abụghị ndị ndị ọjọọ dịka ndị ntaakụkọ na-ahụta ha. Santiago shares his time between Buenos Aires and a luxury apartment on the coast O kwetara n'ezie na mgbe ya bidoro, ọ nwụnwa iji nka ya mee ihe adịghị mma gwara ya mana ị chọpụta nhazi 'Bug bounty' wepụrụ ya anya n'iso ụzọ ọjọọ. 'Bug bounty' Ihe bụg Bounty na-eme bụ ịkwazalite 'hackcing ziri ezi site ịkwụ ndị ọkaibe na nka kọpụta ụgwọ ka ha chọpụta websait ndị nwere agba ndị nwere ịke ịdanye na nsogbu agha ịntanet n'ihi enweghị ezi nchekwa. Dịka nsogbu ozi dị na kọpụta ịgba n'anwụ na-agbalite elu karịa, ọtụtụ ụlọọrụ na-amapụtazi ego gbara ọkpụrụkpụ maka ichekwa kọmpụta ha na bọjet ha. Santi sonyere ụlọọrụ intanet na-eme 'Bug Bounty' n'ụwa niile a kpọrọ- HackerOne. Santi chọrọ ịgbanwe etu ndị mmadụ si ahụ 'Hackers' Kemgbe afọ atọ ha bidoro, akwụọla ihe dịka ndị ọkaibe kọmpụta dị 350,000 ego ruru nde dọla $45m site nụlọọrụ gụnyere Yahoo, Spotify, Airbnb, Adobe nakwa Uber. Ndị ka onye kachasị ndị ọzọ na nka ya, na HackerOne, Santi achọpụtala nje kọmpụta ruru 1600, ebe a kwụrọala ya dọla kwụrụ dọla maka ịchọpụta nje kọmpụta dịka ike ha na-akpa ha. ""Enyerela m ọtụtụ ụlọọrụ dịka Twitter, Verizon, gọọment mba Amerịka nakwa ụlọrụ ndị nọọrọ onwe ha aka ndị m agaghị akpọ aha."" Ugbua, Santiago so na-nwata na-eto eto kachasị nwe ego na mba ya dịka ego ọ na-enweta karịrị nke ndị mụrụ ya na-enweta ugboro iri anọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51957559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51957559,Coronavirus Lockdown: Etu ị ga-esi kwado dika a sị ka a nọdụ n'ụlọ,Ndị Igbo na-asị na nkwụcha abụghị ụjọ.,"Ebe ndị mmadụ kwụ na-eche ka enyochaa ihe ha zụrụ tupu ha akwụọ ụgwọ, n'otu ụlọahịa dị n'Owere Dịka gọọmenti steeti ụfọdụ na Naịjirịa na-akwado ịsị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka igbochi mfesa coronavirus, ọ ga-adị mma ka ị mara etu ị ga-esi kwado ka ihe ghara iribido gị na ndị be gị. Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ikuziri ndị mmadụ etu e si ebi ndụ zuruoke bụ Rajiv Sharma kọwara ihe anọ mmadụ ga-eme iji chebiri mgbe a ga-asị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ. 1. Jide obi gị aka Sharma kwuru na ọ dị mma ka ndị mmadụ kwụsị ige maọbụ ikesa akụkọ ụgha gbasara ọrịa coronavirus. O kwuru na kama ime nke a, tinye uchu n'ime ihe ga-egbochi ya bụ ọrịa ịbata n'ahụ gị site n'iwepụ ụjọ. Jide obi gị aka. 2. Na-eri mkpuru osisi ọfụma Sharma dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ rie mpkuru osisi dịka oroma, , kiwi, oroma, nkịrịsị, guava, grapefruit, akwụkwọ nri dịka broccoli, cauliflower, Brussel sprouts na capsicums nke gụnyere vitamin C. O kwuru na ọ dịmma iri nri Alkaline ya karịrị asidi ọrịa ahụ na-ebute. Ụfọdụ nri ndị a gunyere Lemon, Lime, Avocado, Garlic Mango, Tangerine, Pineapple, Dandelion, Oroma nkịrịsị. 3 Na-akwọsi aka ike akwụsị akwụsị Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị Sharma kwuru ka ndị mmadụ na-akwọ aka ha mgbe ọbụla ghara iji makana asị ka a nọdụ n'ụlọ kwụsị ime nke a. Were kemikalụ na-egbu nje wee na-agbagasị na bee gị. Kpuru akwa eji ekpuchi ihu maọbụrụ na ịgaghị ahapụ imetụ aka n'ihu. 4. Kwupute maka onye na-egosi na o bu ọrịa ahụ Kpesara ndị na-ahụ maka ịchọpụta onye ọrịa coronavirus ji ma ọ bụrụ na onye nọ n'akụkụ gị na-egosi na ha bu ọrịa ahụ. Ịmaghị ndụ onye inwere ike ịzọ site n'ime nke a. 5. Gokọta ihe ndị ga-abara gị uru Nwaane gbaa mbọ gote ihe nri ga-anọteturu gị na ndị be gị aka n'oge ahụ ịnọ n'ụlọ. Gote mmiri ọṅụnụ, ncha na ihe ndị ọzọ eji ehicha ụlọ nakwa ihe nri. Gote ụmụ ihe egwuregwu ga-enyere ụmụ gị aka izu ike ọfụma. Ụfọdụ ihe ga-eme maọbụrụ na ịnọ n'ụlọ kwụsị Akụkọ ga-amasị gị: Abule Ado Explosion: Onye bụ Henrietta Alokhai nke Bethlehem Girls? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-52339193,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52339193,Covid-19: I nwereike ibute coronavirus site n'ahụrụ?,"Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na- efegharị na-ekwu na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ.","Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa akụkọ na-apị. Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 rue ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n' ụkwara maọbụ azụzụ ma a kwaa ụkwara maọbụ maa uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile. Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ọgwụ mgbochi coronavirus, ọgwụgwọ, nakwa etu ndị ọzọ ọrịa a si ekesa. Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanet nke bụ otu dọkịta akpọrọ Andy Tagg malitere na nsonso bu nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ, ọkachasị onye eyighị ọbante. Mana ọkachamara n'ihe gbasara nje (virologist), Ọkammụta Oyewale Tomori sị na, ""onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."" ""E nwere ike ịhụ nje a na ngụ (lung,) nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."" Dọkịta ahụike ọha n'ụlọọgwụ 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), bụ Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist na Naijiria a kpọrọ 'Nigeria Academy of Science' (NSA) bụ Dkta Doyin Odubanjo kwenyere n 'ihe Tomori kwuru. Onajole sị na, ""ọ bụghị eziokwu"", ebe Odubanjo si na ""anụbeghị m ya mbụ"". Odubanjo na Tomori kwuru na ihe ha ma bụ na nchọpụta na-egosi na nje coronavirus nwere ike ịnọ na nsị. Tomori, onye bubu onyeisi NAS sị, ""n'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."" N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, ""nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ogema nnyocha kwuorola na ọ gbakela"". ""Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."" Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsị. O kwuru na coronavirus bụ ""ọrịa ọwa e si eku ume,(gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi na nsị aba n'ọnụ (fecal-oral)"". Dịka coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ a ka na-enyocha, ndọrịtaụka ka aga n'ihu rue oge nchoputa zuru oke ga-ewepụ mgbagwojuanya nile. Anwụnta anaghị ebufe mmadụ coronavirus Ọgwu jị ahụru enyocha ahụ mmadụ apụtaala" afirika-49269765,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49269765,Fake bank alert: Ihe ise ị ga-eji amata 'bank alert' adịgboroja,Ndị oji intanet ezu amapụtala ụzọ ọhụrụ iji na-apụ ndị mmadụ ego ha site n'ịzụ ihe ma zigara onye ha zụrụ ahịa ozi ụlọakụ abụghị nke ọma na-egosi na ha kwụọla ụgwọ ihe ha zụrụ.,"N'ọnwa ole na ole gara aga, ndị uweojii nwuchiri onye dọkịta ghọrọ oji ịntanet ezu, nke jirila ụzọ aghụghọ zụrụ ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụ aha n'ịntanet. Ọ gịnị bụ 'social media' n'Igbo? Chidi Udeogu na Innocent Orji bụ ndị 'software' inginịa n'ụlọọrụ 'Zedcrest Capital' bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịhazi akụnaụba kọwara ụzọ ole na elo ị ga-eji mara ma gbalahụ ozi ụlọakụ adịgboroja. Lee ise n'ime ha: 1. 'Bank alert' adịgboroja na-egosi naanị ego ole a kwụnyere, ebe ozi si n'ụlọakụ gị n'ezie ga-egosi ego ole fọrọ n'akpaego dị n'ụlọakụ. 2. Ọ bụrụ na edemede ozi i nwetara dị iche na nke ị na-enwetabu. Orji kọwara na ozi ""Ndị nke adịgboroja, na-etinye kpọm, rịkọm maọbụ 'underscore' n'aha ụlọakụ na-ezite ozi ahụ, nke a na-ede ya n'obere mkpụrụedemede (small letter)."" Lee elekereaka nke a sị n'ahụ alata ọkụ 3. Ezigbo ozi na-egosi akara anọ ikpeazụ dị n'akara akpaego gị (account number), mana nke adịgboroja anaghị ebu ya. 'Ụzọ ị ga-esi mara 'bank alert' adịgboroja' 4. Ezigbo ozi ga-akọwa ihe ego ahụ bụ ma ọ bụ mwepụ ka ọ bụ mgbakwụnye nyere ihe dị n'akpaego gị n'ụzọ kwesiri ekwesi. 5. Were 'banking app' mara ego ole banyere n'akpaego gị n'ụlọ akụ. Kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya- Chidi Udeogu Ọ bụrụ na obi akaghị gị, ọ kachasị ma mmadụ zụọ gị ahịa dara oke ọnụ ahịa, Udeogu na Orji dụrụ ọdụ ka i jiri 'bankịng app' dị n'ekwentị gị lee akpaego gị n'ụlọakụ tupu ị hapụ onye zụrụ gị ahịa ka ọ lawa. Udeọgụ kwuru ka ị ""kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya,"" maka ndị ụta. A na-ajụ ma abụ m mmadụ - Nigerian Jackie Chan Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45199776,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45199776,Ị hụla etu ndị Igbo si akwado BBC Igbo ka ọ bụ nwaanyị a lụrụ ọhụrụ?,"N'agbanyeghị na BBC Igbo arụọla ọrụ ọnwa isii na Naịjirịa, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-akwado ha ka ọ bụ nwaanyị a lụrụ ọhụrụ maka mbọ ha na-agba ikwalite asụsụ Igbo.","Lekwa ndị mgbasa ozi BBC Igbo Ndị mmadụ bidoro ịhụ uru BBC Igbo baara ndị Igbo, nke mere ka ha bido ikwuputa hoohaa na ha kwadoro ngalaba a. Ọtụtụ na-ekpere ha ekpere ma na-agbakwa ha ume maka ""ihe ọma a ha na-eme"". Ndị otu News Chronicle kwuru na ọ bụ ihe ọma na BBC bidoro nke asụsụ Igbo. N'okwu ha: ""...ihe a BBC meere anyị ga-enye aka kwụsị asụsụ anyị ịnwụfu."" Ha dere sị na Karl Uchegbu kwuru na ""Ọ bụ ihe ọṅụ nye m oge m hụrụ Ọgbakọ BBC Igbo. Achọpụtakwara m na asụsụ Igbo m esighịzi ike. Achọrọ m ikele ndị hibere ihe a. Ụnụ Emeela! Ndeewo nu!"" Gere ihe Igbo bụ ọgaranya na-ekwu maka BBC Igbo Ndị ọzọ gara na Twitter ikwuputa etu ọ dị ha n'ahụ: @mcpherdinand kwuru na obi na-atọ ya ụtọ na e nwere BBC Igbo. @oganiruIgbo kwuru na BBC Igbo na-agba mbọ iru mpaghara Igbo niile. Asụsụ Igbo agaghị anwụ - Amarachi Atama Ndị ọzọ zipụtara ozi ekele: Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke Etu ndị mmadụ si nabata BBC Igbo. @DelaQuaver kwuru sị na BBC Igbo na-enye ya ọṅụ. Na Facebook, ọtụtụ ndị kwuru na obiọma na-eme ha maka ọbịbịa BBC Igbo. Israel Etu kwuru sị: ""Ekele kelere m ndị na-ahụ maka mgbasa ozi a a na-agbasa n'asụsụ Igbo na BBC. Ọ bụ ohere anyị nwere iji kwalite asụsụ na omenaala Igbo."" Nonnie Aneke sị ""Obi dị m ụtọ isoro n'ihe BBC Igbo na-eme na mba niile."" John Hill kwuru sị ""Ọ ga-adịrị ndị BBC asụsụ Igbo nwepụtara elu mma. Chukwu gọzie ụmụafọ Igbo."" Soni Orji kwuru sị ""Obi jurum afọ oge m chọpụtara na BBC emepeela ngalaba asụsụ Igbo."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" egwuregwu-44696562,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44696562,Gịnị ka ọchụchụ Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF ga-apụtara Naịjirịa?,Akụkọ na-ekwu na mịnịsịtri na-ahụ maka egwuregwu enyela iwu ka Amaju Pinnick bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nke a kpọrọ Nigeria Football Federation(NFF) irituo n'oche dịka ụlọikpe.,"Ụfọdụ na-eche na iwu a mịnịsịtrị a nyere nwere ike itinye Naijiria na nsogbu n'aka otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mbaụwa a na-akpọ Fifa n'aha ịchafụ. Ọnụ na-ekwuchitere Solomon Dalung, mịnịsta egwuregwu, bụ Nneka Anibeze kwuru n'ọ bụ ihe ụlọikpe kwuru ka Amajụ Pinnick na ndị ọzọ kwesịrị iso. Na mbụ, Fifa akwadoghị ntuliaka nke Giwa na-ekwu na ya meriri n'afọ 2014 ebe otu mbaụwa ahụ kwuburu na ha ga-akwụsị NFF ọrụ n'ike ma ọ bụrụ na ha mee ntuliaka ọzọ. Agbanyeghị na Pinnick meriri na ntuliaka ahụ emegharịrị, ndị ma ihe a na-ekwu na-akọwa na ntuliaka ahụ akwụghị ọtọ nke mere Giwa jiri gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe n'ihi mpụtara ya. Mana iwu Fifa kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti esoro mkpebi ụlọikpe, ọ ga-emegide NFF na iwu ma nwe ike ịkpatara ha ntaramahụhụ. Ọkaiwu NFF bụ Festus Keyamo ebipụtala akwụkwọ ozi o kwuru si n'aka onyeisi Fifa bụ Fatma Samoura e kwuru na ọ bụ Pinnick na ndi otu ya ka ọ ma dịka ndị isi NFF. N'akwụkwọ ozi ahụ, Samoura kwukwara na Fifa ka kwụ na mmachi ha machiri Giwa. Cheta na Fifa amachibiola NFF mbụ ka gọọmenti tinyere aka n'okwu NFF. Akụkọ ga-amasị :" afirika-48814081,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48814081,Ecowas Summit: Issoufou Mahamadou bụzị onyeisi ọgbakọ a,Onyeisiala mba Niger Republik bụ Issoufou Mahamadou abụrụla onyeisi ọgbakọ jikọrọ mba nile dị n'ọdida anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas.,"Ụfọdụ ndi isiala mba ndị mebere Ecowa Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari hafere Mahamadou ọchịchị n'ọgbakọ Ecowas nke iri ise na ise nke e mere na Abuja ụbọchị Satọdee. A nọkwara n'ọgbakọ ahụ cheta ma tube dibia Bekee Ameyo Adadevoh nakwa Kofi Annan ugo. Adadevoh bụ dọkịta nyere aka gbochie mgbasa ọrịa Ebola na Naijiria, ebe Annan bụ aka chiburu ọgbakọ mba uwa a kpọrọ United Nations. Cheta na Buhari nọkwa n'ọgbakọ ahụ kwuo na ndị isiala mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ga-emepụtarịrị otu atụmatụ iji buso nsogbu nchekwa agha na mpaghara ahụ. O kwuru nke a na nzụkọ iri ise n'ise nke ọgbakọ Ecowas na Abuja n'ụbọchị satọde. Ndị otu Ecowas kpebikwara na mba ọdịda anyanwụ Afrịka ga na-ejizi otu ụdị ego a kpọrọ 'Eco' were azụkọrịta ahịa. Aka ndị uweojii akpara otu nwata nwaanyị dị afọ iri abụọ nke akụkọ kwuru sugburu dị ya na Nsugbe. Ndị uweojii kwuru na nke a mere dịka nwaanyị ahụ na di ya na-ese okwu ma na-alụkwa ọgụ. E nyere aha nwaanyị ahụ dịka Makudochukwu ebe aha nwoke ahụ bụ John Bosko Ngu. Akụkọ kwukwara na agbalịrị buga nwoke ahụ ụlọọgwụ mana azọtaghị ndụ ya. Ihe mere na AFCON taa Mba Kamerun na Gana gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere onwe ha taa. Onwekweghi onye nyere goolu ọbụla nke fọrọ ibe ya ịsata ya bụ goolu. Cheta na Super Eagles Naịjirịa ga-ezute Madagaska n'ụbọchị ụka. Na mba ofesi, Gọọmentị Naịjirịa adọọla ndị na-eme njem na mba Itiopia aka na ntị sị ha ejila ego gafere puku dọlla atọ bata n'obodo ahụ. Ha kwuru na mba Itiopia ga-ejichi ego ọbụla karịrị nke a n'Iwu ọhụrụ mba abụọ a weputara iji buso agha megide nrụrụaka ego. N'egwuregwu, Gernot Rohr na Ahmed Musa Osote onye ndu otu Super Eagles bụ Ahmed Musa ekwuola na ngalaba NFF ka ji ha ụgwọ asọmpị ha gbara agba. O kwuru nke a n'ọgbakọ super Eagles na ndị ntaakụkọ nwere n'obodo Alezandrịa n'Ijipt. Gee Nkeji nke mgbe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-51874222,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51874222,Coronavirus: Ihe ise mba ụwa kwesịrị ịmụta n'aka Naịjirịa,Ọrịa coronavirus agbasaala na mba 114 n'ụwa kamgbe ọ malitere n'obodo Wuhan nke mba Chaịna.,"Naịjirịa sokwa na mba ebe ọrịa batarala. Oge nwoke onye Itali bubatara ọrịa na Naịjirịa, egwu tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ha che na gọọmentị agaghị enwe ike igbochi mgbasa ya bụ ọrịa Mana gọmentị Naịjirịa akpaala ike igbochi mgbasa ọrịa ọjọọ nke mere ka otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' weliere ha aka elu. Lee ihe ise ụwa kwesịrị ịmụta n'otu Naịjirịa si gbochie mgbasa ọrịa COVID-19 'Genome sequencing' Naịjirịa bụ mba izizi n'Afrịka mere ihe a kpọrọ 'genome sequencing' nke gosiri na nje ahụ bụkwa ụdị nje nke na-agbasa na mba Itali nakwa obodo Wuhan. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwuru na ndị nyere aka ime nke a bụ ndị mịnịstrị ahụike nke Legos steeti. Ha kesara ihe ha chọpụtara na nchọpụta a nye ndị ọrụ ahụike n'akụkụ ụwa niile. Onyeisi WHO kelekwara ndị ọkammuta sayensị Naịjirịa maka nke a. Mgbasa ozi Ụlọọrụ mgbasa ozi a tụkwasịrị obi dịka BBC na-agbasara ndị ọha obodo ihe niile ha kwesịrị ịma nakwa ihe ha kwesịrị ime iji zeere ọrịa ọjọọ a. Kwa ụbọchị, ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche na-ewepụta akụkọ iji kuziere ndị mmadụ ihe ha ga-eme ma ha hụ onye na-arịa ọrịa yiri coronavirus. Ịchọta ndị niile ha na onye mbụ bu ọrịa a mekọrọ Okwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha Gọọmentị Naịjirịa chọtacha ndị niile ha na nwoke Itali ahụ bubatara ọrịa coronavirus bakọrọ ụgbọelu. Na-agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ndị ahụ anọghị na Legọs, gọọmentị kpọtụụrụ ha niile ma dọọ ha aka na ntị ihe ha ga-eme. Ọgbakọ onyoonyoo kama ọgbakọ ihu na ihu Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị Dịka gọọmentị mara ọkwa na ọrịa coronavirus abatala Naịjirịa, ọtụtụ ụlọọrụ machiri inwe ọgbakọ ihu na ihu, kama ha malitere iji ịntaneetị enwe ọgbakọ n'igwe televishọn. Nke a belatara mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya, nke bụ otu ụzọ ọrịa a si agbasa. Itinye ihe karịrị mmadụ 100 na 'quarantine' Na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị, Kọmịshọna ahụike na Legọs steeti bụ ọkammụta Akin Abayomi kwuru na ha etinyela ihe karịrị mmadụ 100 na kwarantaịn. Ndị a bụ ndị ha na nwoke Ịtalị ahụ bubatara ọrịa coronavirus mekọrịtara ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Amputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'" afirika-47821099,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47821099,Tattoo: 'Ise uhie ma ọ bụ igbu ichi abụghị ịda iwu',Ndị ọkachamara n'ihe metụtara omenala Igbo arụtụla aka n'ihe mere ndị Igbo na-eji ese uhie ma ọ bụ igbu ichi n'ahụ ha.,"Nke a na-abịa dịka ndị uweojii na Legọs kwuchara na ha ga-amalite ịnwụchi ndị ntoroọbịa bu isi dada nakwa ndị sere uhie ma ọ bụ gburu ichi n'ahụ ha. Agbanyeghi na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii a bụ Bala Elkana agọrọla aka ya maka nke a, ọtụtụ ndị mmadụ karịsịa ndị maara omenala nke ọma katọrọ okwu ya. Ọ bụ okwu a mere BBC Igbo ji kpọtụrụ ndị ọkachamara abụọ n'omenala Igbo bụ Ọzọ Nonso Mcginger Ibeneme na Ezenka Udochukwu Maurice ka ha tinye ọnụ n'okwu a. Naanị ndị dị ike ga-egbụ ichi N'azịza nke ya Ọzọ Mcginger kwuru na ịka ihe n'ahụ bụ ihe malitere gboo n'ala Igbo, iji gosipụta ọtụtụ ihe dị icheiche. O kwuru na nke a gụnyere; ịka ihe n'ahụ maka ọgbanje, ndị bara na mmọnwụ, igbu ichi maka ndị chiri echichi, ịte uhie maka ịchọ mma ụmụnwaanyị. Ọtụtụ mmadụ nwụrụ maka ịgbuichi a N'otu aka ahụ Ezenka Udochukwu kwuru na e nwere ụzọ ihe anọ mere ndị Igbo ji egbu ichi. Nke a gụnyere; Igbu ichi nke agbụrụ iji mata ebe mmadụ si, igbu ichi nke eji agwọ mmadụ ọrịa, igbu ichi maka echichi, igbu ichi maka ịkanye mmadụ ọgwụ n'ahụ. Mana ha kwuru dịka ugbua na omenala Igbo na-agbanwe nke mere ndị mmadụ anaghi eji zi ike ese uhie ma ọ bụ egwu ichi n'ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43625233,https://www.bbc.com/igbo/43625233,Ihe dara n'ala emetula aja - Obasnajo,Olusegun Obasanjo agwala ndị Naịjiria ha chee echiche ọfụma maka ị tịnyere gọọmentị dara ada na ntuliaka nke 2019.,"Nke a ga-eme ya ụgboro abụọ Obasanjo n'akatọ Buhari na otu ya bụ APC n'ime ọnwa atọ. Ọ sị na ha nabata gọọmenti a ọzọ ọ ga-egosi na ndị Naịjirịa na-akwado ihe ojoo ma ọ bụrụ na ha tinye kwa ndị emeghị ka ha sị kwu n'ọkwa ọchịchị ọzọ. O kwuru ihe ndị a ebe otu ọhụrụ a kpọrọ 'New Nigeria Group' gara ị leta ya n'ụlọ ya. Obasanjo ji kwa ohere ahụ were bo gọọmentị ndị APC ebubo na ha butere atụmatụ mebiri ahịa, nakwa ahụhụ dị icheiche na ndụ ndị ala Naịjiria. Okwu ya ebeghị sọsọ n'otu APC, ọ gara n'iru katọ etu PDP sị ndị mmadụ agbaghara maka arịrịọ ha rịọrọ n'izuụka ole nn'ole gara aga. Obasanjo sị na ọ bụghị otu APC maọbụ PDP ga-ejigide ala Naịjiria ma butekwara ha ọganiru n'udo. Ọ sị ""Ihe anyị chọrọ ụgbụa bụ otu si n'ime igwe mmadụ were pụta, otu ga-ebu ọdịnma ndị mmadụ n'obi"". Obasanjo ji ndụmọdụ mechie okwu ya ọ sị ha nnukwu ọrụ dị mana ha nwere ịke ị mee ihe dị na ya. Gọọmenti Muhammadu Buhari asabeghị okwu Obasanjo kwuru, mana ha jiri nwayo nwayo sa nke okwubụrụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara okwu Obasanjo: Onye ọkaiwu Festus Keyamo kwuru n'akara tuwịta ya Onye Sịnetọ bụ Shehu Sani kwuru uche ya Femi Fani-Kayode onye bụbu Minịsta Njem ụgbọelu kwuru nke ya Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46727234,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46727234,UNICEF: Otu n'ime ụmụaka atọ a mụrụ na nkọrọ na-anwụ,Ndị UNICEF ewepụtala akwụkwọ ozi site n'aka onye na ekwuchitere ha ọnụ bụ Pernille Ironside.,"Ha kwuru na ụmụaka ruru puku nari atọ na ụma (300,000) ga-awuchi n'uwa a n'ụbọchị izizi afọ ọhụrụ. N'ime ụmụ ọhụrụ na-abata uwa, ụmụaka puku iri abuọ na ise na ụma (25,000) ka a ga-amụ na mba anyi bụ Naijịrịa. Etu okwu a siri wee gbasa anyị karịa bụ na ha kwukwara na otu n'ime ụmụaka atọ amụrụ na ala anyị na-anwụ n'ihi na ụmụnwaanyị na aga na nkọro amụ nwa. Lee ụfọdụ n'ime ebe ndị a ụmụnwaanyị na aga amụ nwa. 1. Mama Ijaw Ebe a bụ ebe n'adịkebe n'ogbe, ebe ụmụnwaanyị na-aga ka nwaanyị n'aghọ nwa hịaa ha aka na akpa nwa. Obụrụ na achọpụta na nwa kpodoro isi na ala n'ime afọ, mama Ijaw ga eji aka ya were tụgharịa nwa ahụ n'ime afọ nne ya. Ụlọ Ekpere Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere okwukwe na ọ bụ naanị n'ụlọ ekpere ka ha ga amụnwu nwa ha n'udo. Ha na akwakọrọ jee ebe ahụ ka ekpewere ha ekpere ruo oge ọmụpụtara nwa ya. Ụlọ nke ha Onwere ụmụnwaanyị bụ na ọbụrụ na ha amụghị nwa n'ụlọ ha, ọpụtara na onweghị ebe ọzọ ha ga amụnwụzị ya. Ime mewe ha, nne ha maọbụ onye ọzọ katagoroahụ ga-abịa be ha, mụọ ha nwa. Ọmụmụ Ndaba Ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị aga ụlọọgwụ, ya bụ na ha amaghị mgbe ọ bụ oge ha ịmụ nwa. Ọ na adabara ụfọdụ ndị na ahịa, n'ime ụgbọala, n'ụlọọrụ, n'ugbo, n'ụlọụka wee dịrị gawa. Ebe ọbụla ime mewere ha ebe ahụ ka ha ga-amụ nwa. Mana Doktọ ahụike ụmụnwaanyị akpọrọ Ebuka Akaghara kwuru na ọ dịghị mma ka nwaanyị na-aga ebe na-abụghị ụlọọgwụ ga-amụọ nwa. O kwuru na ndị dibia Igbo enweghị akurungwa pụrụiche ha ga-eji gbochi ụfọdụ ọdachị na-adapụta dịka oke mmefu ọbara, maọbụ igwe eji echekwa nwa amụkworo amụkwọ. Gere ihe okwuru n'uju ebe a. Maternal mortality rate: Ịmụ nwa ebe na abụghị ụlọọgwu nwereike imenina nne na nwa -Dọkita Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-47664852,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47664852,Nigeria vs Seychelles: Super Eagles abọrịala Seychelles ka ọkụkọ,Ugo Naịjirịa ji eje mba akparala ọkụkọ ndị Sychelles ma dọrie ya n'asọmpị ikpeazụ eji etozu oke n'Iko mba Afrịka.,"Super Eagles nwetere goolu mbụ ha bụ penariti site n'aka ọgba n'ihu bụ Idion Ighalo na nkeji iri atọ na ise. N'atụfughị oge n'ihe dịka nkeji iri anọ na otu ndị Seychelles mere ka ha bụ dimkpa ma saa goolu ahụ site n'aka Roddy Melanie. Otu egwu bọọlụ abụọ ndị a nọ n'ogogo a rue ngwụcha ọkara mbụ asọmpi ahụ. Dịka ọkara nke abụọ malitere na nkeji iri ise na otu, ugo Naịjirịa wee felie ma wụnye goolu ọzọ nke Henry Onyekwuru ji isi nye N'iji gosizie mba Seychelles nkarị Moses Simon mezuru ya ọkpụ goolu atọ chara acha asatara naanị otu. Mmeri a mere Naịjirịa ji gbaa ndị mbụ n'otu ha n'itozu oke asọmpi Iko mba Afrịka. Ebe Seychelles buru klassị n'isi dịka ha enweteghi otu mmeri n'agba ntozuoke a niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-46546403,https://www.bbc.com/igbo/media-46546403,Australia ekwetala na West Jerusalem bụ isiobodo Israel,Praịm Minista mba Ọstrelia bụ Scott Morrison ekwuola na gọọm̀entị ya ekwetala na West Jerusalem bụ isiobodo Izrel.,"Ọ teela ndị Izrel mewere ka ụwa kwete na isiobodo ha bụ Jerusalem Mana o kwukwara na ha agaghị ebufu isiụlọọrụ ha na Tel Aviv ruo mgbe a ga-enwe ezi mkpezi ebe ahụ. Ọ sịkwa na n'ezie na gọọmentị ya nabatakwara na-ọdị mkpa ndị Palistaịn ịnwete mba nke ha ga-eji East Jerusalem mere isiobodo. Okwu gbasara Jerusalem so na ọkpụkpụ gbadoro n'olu amaghị ka a ga-eme n'ihe gbasara esemokwu Izrel na Palistaịn. Ndị ụwa kpụ ọnyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump n'ọnụ n'afọ gara aga mgbe ọ sị na ya anabatala Jerusalem dịka isiobodo Izrel. N'ọnwa Mee ka Trump bufere isiụlọọrụ mba Amerika Jerusalem. Ihe a Trump mere bụ ihe nyịrị ndị ọchịchị mba Amerika ndị ọzo ọmụme. Kedụ ihe Onyeisiala Ọstrelia kwuru? Scott Morrison kwuputara nke a ka ya na ndị ọnụ na-eru na okwu na mba Ọstrelia nakwa mba ụwa gbachara izu. Okwuru na Sydney ụbọchị Satọde na "" Ọstrelia anabatala na West Jerusalem bụzi isiobodo Isrel."" ""Anyị ga-ebufee isiụlọọrụ anyị dị na mba Izrel na Jerusalem mgbe akpabiri ụka esemokwu dị na mba abụọ a."" Ka ọ dị ụgbụa, Morrison sị na Ọstrelịa ga-amalite mmekọ maka nchekwa na azụmahịa na West Jerusalem. Praịm Minista kwukwara na Ọstrelia nakwa akwado ọchịchị onye kwuo uche ya n'obodo ndị Arab gba gburugburu. Mgbe amalitere mkparịta ụka a na ọnwa nke iri n'afọ a, ndị Palistịan anabataghị ya ebe obi bụ ndị Izrel sọ ọṅụ. Onye Morrison na-eso n'ọchịchị bụ Malcolm Turnbull anabataghị atụmatụ a ma ọlị. Akụkọ ga-amasị gị" media-45673032,https://www.bbc.com/igbo/media-45673032,Ebubo mmaja: Ọ bụ ndị ọkaiwu Naịjirịa mebiri aha ha - Eze,Ndị ọkaiwu n'Anambara steeti ekwuola na ha agaghị ekwe ka ndị uweojii majaa ha ọzọ na steeti ahụ.,"Ọtụtụ ndị ọkaiwu na-ekwuchitere ndị ndọrọndọrọ ọnụ ha ụlọikpe Ọkachamara Ilochi Okafor bụ onye ọkaiwu Naịjirịa kwuru nke a ebe ha na anabata afọ ọhụrụ n'ọrụ okaiwu na Naịjirịa. Okafor kwuru na mmaja eruola ebe ha atụghị anya nke mere ha na-ebo ndị uweojii ebubo na ha na-atọzị maọbụ wakpo ndị ọkaikpe. Mkparị a sị n'aka ndị ọkaiwu bịa Mana na nyocha BBC Igbo mere maka ebubo a, otu ọkaiwu bụ onye nkuzi iwu na Mahadum Katsina aha ya bụ Chukwuemeka Eze kwuru na ọ bụ ndị okaiwu butere mkparị a. Ọ gwara BBC Igbo na ndị okaiwu emetọọla aha ha ebe ụfọdụ n'ime ha na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme nruru aka. Mana iwu kwuru na onyeọbula agbanyeghi ebubo dị ya n'isi ga-enwe ọkaiwu nke ya Eze kwuru: ""Ndị uweojii na-ahụ mpu ha na-eme, ya mere enweghị nsọpụrụ n'ahụ ha"" Ha kpuru isi iwu n'ala Eze kwusirike na ọtụtụ ndị ọkaiwu Naịjirịa so na ndị na-emebi obodo makana ha na-ekpudo iwu isi n'ala. O kwukwara na ihe a na-eme bụ ihe ịdọ aka na ntị ka ha chegharịa. ""Ọ bụrụ na onweghị onye na-enye ndị ọkaiwu nsọpụrụ, ọ pụtara na okwu igbaso ihe dịka iwu siri kwu nke ha kpọrọ 'rule of law' na Bekee nọ na nsogbu."" Ihe ga-eme n'ihu Ọkachamara Okafor kwuru na ha na ndị isi ọchịchị ndị uweojii na steeti ahụ ga-enwe nzukọ maka nsogbu a. Mana Eze kwuru na ọ bụ nanị ikpupu ha n´ụlọikpe ngwa ngwa mgbe ọbụla ha mere udi ihe a ga-ebi okwu a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45907768,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45907768,Abia fuel explosion: Di na nwunye ọkụ gbara anwụọla,Kọmishọna na-ahụ maka ahuike na Abia steeti bụ John Ahukannah a gwaala BBC Igbo na ọ bụghị ezioikwu na mmadụ iri abụọ nwuru na ụlọọgwụ Absuth.,"Abia fuel explosion: Di na Nwunye bi n'ụlọ m rere ọkụ Okwuru na onye ọ bụla na-atụ ụdịrị asị ahụ achọghị ọ dịmma Abia steeti. Ahukannah kwuru na mgbe ihe mechara, na gọọmentị Abia gagharirị gụkọ ọnụ ndị niile metutara ma gwa ndị na-ezo ezo ha bia ka-agwọ ha. O kwukwara na ọ bụ naanị mmadụ anọ ka ebugara n'Absuth mana etu ọkụ si gba ha mere ha ji n'ọrọ n'etiti ọ dịndụ ọnwụ ka mma. Ihe ruru mmadụ 200 nwụrụ na ọkụ a gbara na Osisioma Kọmishọna na-ahụ maka mgbasi ozi na steeti ahụ bụ John Okiyi jikwa ohere ahụ yọọ ndị mmadụ ha ejila ọnwụ maọbụ ihe mberede wee na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị. Okiyi kwuru ruo ugba, gọọmentị Abia steeti achọpụtabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ. O kwuru na ha na-eme nyocha ị chọpụta ya. Cheta na Chidiebere Njoku kwuru na ndị niile ọkụ gbara n'ihe mberede osisioma ebutere n'ụlọọgwụ (Abia state university teaching hospital) nwụrụ. Njoku kwuru na ihe kpatara ọnwụ mberede a n'ụlọọgwụ a bụ maka na e nweghị ọkụ latrik mgbe ya gara ịleta ndị ọkụ a gbara. O kwukwara na ha nweghị ndị ọrụ ahụịke zuru oke n'ụlọọgwụ ahụ nke mere na ndị ọrụ ahuike na-akpọta ndị be ha ka ha bia nyere ha aka. Ụlọgwụ a bụ nke gọọmentị Abia steeti na-elekọta N'okwu ya, ""ụbọchị Satọde m kpọrọ Samuel Nwaokonko na Chamberlain Adiaso wee gaa ebe ahụ hụ na ọ bụ naanị otu nọsụ na-elekọta mmadụ anọ ọkụ gbatọrọ."" Njoku kwuru na ajụjụ ọ na-ajụ bụ kedụ uru kọmishọna na-ahụ maka ahụike bara? Ọ na-ajụkwa ọ na ọ bụghị ụlọọgwụ gọọmentị bụ ihe a? Ka ọ dị ugbua, Njoku kwuru na di na nwunye ọkụ gbara na ya bụ ihe mberede anwụọla. A ga-eli ha na be ha bụ Isuochi. O kwuru na ihe karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla n'ụlọgwụ a kemgbe ụbọchị Fraide Ọctober 12 ihe mberede a mechara. Njoku na-ekwusi ike na ọ bụ gọọmentị gbutọpụrụ ndị a. Njoku na-azọ oche nnọchite anya ndị Osisioma Ngwa North dị n'Abia steeti n'ụlọomeiwu nke steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43773972,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43773972,"Asompi CW: Naijiria nwetara ọlaedo 9, ọlaocha 9",Egwuregwu Commonwealth ọgbọ 21 nke Gold Coast mba Ụstrelịa abịala na ngụcha.,"Mba Saụt Afrịka ritere goldu iri na atọ ebe Naịjirịa ritere goldu itoolu Mba mpaghara Afrịka so n'egwuregwu a gụnyere Saụt Afrịka, Naịjirịa, Kenya, Yuganda, Botswana, Namibịa, Kameruun, Ghana, Malawi na dị ọzọ. Ụfọdụ ndị mere nkeọma dịka Saụt Afrịka, Naịjirịa na Kenya, ebe ndị ọzọ atagbutaghị ihe ọ bụla. Nwafọ Igbo Roland buliri kg 194 nyere ya akara 224.3 Naịjirịa bụ ndị abụọ n'Afrịka mabụrụ ndị itoolu n'ọkwa ihe nrite mba Commonwealth dịka ha ji ọlaedo itoolu, ọlaocha itoolu na ọlanchara isii. Mba Saụt Afrịka kachasị mee nkeọma n'Afrịka dịka ha ritere ọlaedo iri na atọ, ọlaocha iri na otu na ọlanchara iri na atọ nke mere ha ndị isii n'ọkwa ihe nrite. Mba Kenya jiri ọlaedo ano, ọlaocha asaa na bronzu isii na-esote Naịjirịa, ebe Yuganda nwetere ọlaoedo atọ, ọlaocha otu na ọlanchara abụọ. Mana ndị kachasị mee nkeọma n'ụwa niile bụ ndị Ọstrelịa bụ ebe a na-eme egwuregwu ahụ. Ha ritere goldu iri asatọ, sịlva iri ise na itoolu, ọlanchara iri ise na itoolu. Namibịa nwetere ọlaedo mbụ ha site n'aka Helalia Johannes England na-esote ha ritere ọlaedo iri ano na ise, ọlaocha ano na ise, na ọlanchara iri ano na isii. Mba Indịa jiri ọlaedo iri abụọ na isii, ọlaocha iri abụọ na ọlanchara iri abụo bụrụ ndị atọ n'ogo ihe nrite" afirika-44183315,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44183315,Ọgụ na mgba aghasaala APC Congress n'Enugwu,Ndị otu Ndọrọndọrọ ọchịchị 'All progressives congress' (APC) nke Enugwu ejirila ịlụ ọgụ na ngagharị iwe kposaa ntuliaka ha kwesịrị iji họpụta ndị ọchịchị ọhụrụ na pati ha.,"Ụfọdụ ndị na-akwado APC mere ngagharị iwe n'Enugwu Tata bụ Mee 19 bụ ụbọchị APC hibere iji mee ya bụ nhọpụta na Nnamdi Azikiwe Stadium dị n'Enugwu. N'ụtụtụ oge BBC Igbo rutere na ya bụ ogige egwuregwu, narị kwụrụ narị ndị mmadụ bucha akwụkwọ na-eme ngagharị iwe ma na-ekwuputa aha onye ha chọrọ ka ọ chịa ha. Ozugbo oge ruru iji kpọpụta ndị aha ha dị n'akwụkwọ, ndị igwemmadụ juru ebe ahụ bidoro mewe ngagharị iwe sị na aha ha adịghị n'akwụkwọ INEC ji. Tony Nwoye, onyeisi ndị APC n'Enugwu Ndị uweojii nwara ike ha ịkwụsị ya bụ katakata na-ada mana ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ bara mebisịa akwụkwọ ma chụpụ ndị niile si APC Abuja nakwa INEC ezi. Ndị uweojii jizi egbe na ọkụ oyibo nke a kpọrọ 'teargas' wee chụsaa ndị ahụ na-akpa aghara. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na ya bụ pati, dịka onye bụbụ gọvanọ Enugwu bụ Sullivan Chime, Sinetọ Ken Nnamani, Emma Enukwu, Ben Nwoye, Juliet Ibekaku, Okey Ezea, Baywood Ibe, na ndị ọzọ, jizi ọsọ gbapụ na ya bụ ogige. Ndị bịara ntuliaka APC n'Enugwu" afirika-43467586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43467586,Mwakpo Dapchi: A gbara ndịagha Naịjirịa ama - Amnesty,"A gbara ndịagha Naịjirịa ama na ndịagha Boko Haram nọ nso obodo Dapchi mana ha azaghị, nke nyere ndị omekome a ohere ịtọrọ ụmụakwụkwọ 110 ne-enweghị onye jụrụ ha ese, ka ndị Amnesty International kwuru ụnyaahụ.","Ụmụakwụkwọ nọ na Dapchi karịrị 900 Ntọ a atọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi dị afọ 11 ruo 19, yiri ụdịrị ntọ ndị Boko Haram mere n'afọ 2014 n'obodo Chibok, ebe ha nwụchiri ụmụakwụkwọ 276. Mwakpo Dapchi bụ ezigbote nsogbu banyere onyeisiala Naịjịrịa bụ Muhammadụ Buhari bụ onye batara n'ọchịchị maka nkwa o kwere na ọ ga-ebuso ndi Boko Haram agha karịa etu onye chịbụrụ Naijirịa bụ Goodluck Jonathan siri mee. ""Ndị na-achị Naịjirịa dara n'ọrụ nchekwa ọha, etu ha siri daa ya na Chibok afọ anọ gara aga,"" Osai Ojigho bụ onyeisi Amnesty International na Nigeria kwuru n'akwukwọ ha zipuru. ""Agbanyeghị na a gwara ha ugboro ugboro na Boko Haram nọ n'ụzọ Dapchi, o dị ka ndị uweojii na ndịagha emeghị ihe ọbula iji gbochie ntọrị a,"" Ojigho kwuru. Otu onye na ekwuchitere ndịagha Naijirịa gọrọ na ha nwetara ama maka Boko Haram ịnọ na gburugburu Dapchi, na-asi: ""Onweghị ihe dịka ihe ahụ ha na-ekwu."" O kwuru na ọbụru na Amnesty nwere ozi dị mkpa dika ụdịrị a, ha kwesịrị ime ka ndị onyeisiala họpụtara ka mberede Dapchi mere mata. Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu nọ na-atụ anya ha Ndị Amnesty na-ekwu na ndịagha Nigeria na ndị uweojii nwetara ozi ugboro ise na Boko Haram na-abịa Dapchi n'ekwentị, elekere anọ tupu ha awakpoo obodo ahụ, mana ha emeghị ihe ha kwesịrị ime iji gbochie ha, maọbụ mee ka a zọpụta ụmụakwụkwọ ahụ ka atọọrọ ha. ""Ndịagha Naịjirịa wepụrụ ndị agha n'ebe ahụ na Jenụwarị, nke mere na ndị nchekwa kwesịrị ịhụ maka obodo ahọ nọtere aka na Dapchi,"" Akwụkwọ Amnesty kwuru. Ka otu ọnwa gara, onweghị onye ma ihe mere ụmụaka a. Mgbe awakporo ụlọakwụkwọ na Dapchi, ụfọdụ gbabara ọhịa Nne na nna ha na ndị ọchịchị ekwugbeghị ma ha anụla ihe ọbụla gbasara ma ụmụakwụkwọ a adị ndụ. N'ọzọ, ụmụaka apụtabeghị n'ihe onyonyo ndị Boko Haram. ""Ndị ọchịchị Naịjirịa kwesịrị inyocha ihe mere ka ndị Boko Haram nweta ohere tọrọ ụmụaka, na ihe mere ejighị gbaa mbọ ka egbochie ya,"" Ojigho kwuru. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru n'izuụka gara aga na o nyela iwu ka ndị nchekwa niile chọwa ụmụaka a, ma ṅụọ iyi na gọọmentị agaghị ezu ike ma ọ bụrụ na agbapụtaghị ha. Buhari kwukwara na ya ga akparịta ụka iji gbapụta ha, nke gosiri na ndịagha nwere ike ịda n'ịchọta ụmụakwụkwọ Dapchi a." afirika-44288704,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44288704,Ihe asaa nwoke Igbo chọrọ na nwaanyị ọ ga-alụ,"A gbacha alabanko, oru oge ịlụ nwaanyị, nwoke bụ nwa afọ Igbo na-etinye anya na mmiri ịhọrọ nwaanyị ọ ga edulara nne ya.","Nwoke Igbo bụ nwa afọ chọrọ nwata nwaanyị mara mma ma nwekwa ezi agwa BBC Igbo na ụmụnwoke Igbo agba ọhụrụ ụfọdụ nwere mkparịtaụka banyere ihe ndị ha chọrọ na nwaanyị ha ga-alụ. Lee okwu gbara ọkpụrụkpụ pụtara ugboro ugboro n'ihe ha kwuru: 1. Nkwanye ugwu Ọtụmadị ka nwoke Igbo nwere mmasị ebe nwaanyị chara anya dị, ọ chọghị nwaanyị ya na ya ga-na-azọ isi ezinaụlọ ya. Nwa afọ Igbo chọrọ nwaanyị ga-akwanyere ya ugwu n'ime ụlọ ma na mbara, kwanyere nne na nna ya na ndị ezinaụlọ ya ugwu site n'okwu na omume. Nwoke Igbo bụ nwa afọ chọrọ nwaanyị na-akwanyere ya na ndị mụrụ ya ugwu n'okwu na omume 2. Ezi agwa Ilu Igbo na-ekwụ sị, 'Ezi agwa ka ego'. Nwoke bụ nwa afọ na-akwado ịlụ nwaanyị, otu n'ime ihe ọ na-ajụ banyere onye ọ ga-alụ bụ o nwekwara ezi omume? Ọ bụkwa nwata nwaanyị a zụrụ azụ? Dịka otu nwa afọ a kpọrọ Emeka Ejere si kọwaa ya, ihe e jiri mara nwaagbọghọ nwere ezi agwa na ""ọ na-erube isi; mara ihe kwesịrị ime na mgbe e kwesịrị ime ya; na-ekele ekene ma na-anabatakwa ekele nke mmadụ"". 3. Ntụkwasị obi Otu n'ime ihe dịkachasịrị nwoke Igbo chọrọ nwaanyị mkpa bụ nwanyị ọ ga-atụkwasị obi. Nwaanyị na-agba n'ezi bụ ajọọ ahịa onweghị nwoke Igbo ọ ga-amasị ịzụ. Nwoke agba ọhụrụ Igbo chọrọ onye ha ""ga-akpọ gaa ihe"" 4. Nwaanyị na-adị ọcha Nwoke agbọ ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị na-adị ọcha ma na-edobekwa gburugburu ya ọcha. Nwaanyị na-erụ unyi bụ agbawa-aghara ebe ndị ụmụokoroọbịa nọ. 5 Nwaanyị gụrụ akwụkwọ/na-agba mbọ Obodo bụ igwe ugbua n'ala anyị. Onye agbasighị ike agaghị azọta onwe ya n'ihi na akụnaụba ala anyị na-agba egwu 'onye-chụta-o-rie.' Nke a mere na ọtụtụ okorobia Igbo dịka Chinedu Uzoegbu na-achọzị ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ maọbụ onye nwe ezi aka ọrụ - nwanyị na-agba mbọ. Uzoegbu gwara BBC, ""A chọrọ m nwaanyị gụrụ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ gụghị akwụkwọ ọ ga-adị nnjikere ịgụ akwụkwọ."" Dịka ihe siri kwụrụ ugbua, ọ bụsị onye weta, ibe ya eweta. Oge nwaanyị ga-adịka 'Oriaku' aga-ala! 6 Nwaanyị nwere ọgụgụ isi Nwoke agba ọhụrụ chọrọ nwaanyị ma ihe, onye ya na ya ga na-atụkọ alọ maka ọganihu ezinaụlọ ha. 7. Nwaanyị mara mma E tere ogiri, etere ụgba, nwaokorobịa agba ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị mara mma. Dịka Nonso Akosa si kwuo ya, ""onye ị ga-akpọ gaa ihe.""" afirika-43110692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43110692,Lasa fiva: Ọnwụ mmadụ atọ na nkwadọ steeti dị ịcheịeche,Ọtụtụ steeti ekwụpụtala ịhe dị ịcheịche ha na-eme ikwado maka ị buso ọrịa Lasa fiva agha.,Oke bụ anụmanụ na-ebu nje ọrịa lasa fiva nke ọ na-agbasa site nyụnye nsị maọbụ mamịrị n'ime nri mmadụ na-eri Komishọna na-ahụ maka ahụike na Abia steeti ekwuru na ọ bụ eziokwu na enwebeghị ọrịa ahụ na steeti ha mana ha dị njikere. Ọ gwara BBC n'elụ ekwentị na ha na-agba mbọ na-akụziri ndị mmadụ maka ọrịa ahụ na atụmatụ ha ga-eji gbochie ya. Komishona ibe ya n'Imo steeti bụ Angela Uwakwem kwuru na ha na-agba mbọ ịgbuchasị oke na-ebugharị ọrịa nke a. Ha kwukwara na ha enyela ndị dọkịta akwa mgbochi iji gwọ ndị nwere ọrịa ka ha ghara ibute ya. Akụkọ na-ekwu na mmadụ atọ nwere Lasa fiva anwụọla na Delta steetị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọrịa ahụ kemgbe o bidoro n'ọnwa gara aga na steeti ahụ rue asaa. Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa ahụisike nke bụ Dkta Mordi Ononye kwuru na-ebidola nyocha mmadụ iri abụọ na-anọ echere nwere ọrịa a. Ọ sị na mmadụ abụọ na ndị nwụrụ sị Anambra steeti ma nke ọzọ bụrụ onye Delta. afirika-50343738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50343738,Ọrụ amalitela n'Ọdọ Ụgbọelu Enugu?,Agbanyeghị na Minista na-ahu maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika gara Enugwu ụnyaahụ ga kụpụ aka maka malite ọrụ n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu ebe ahụ ka tọgbọ chakoo.,"Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, ọ bụ naanị okwute bụ akara ụlọọrụ PW gosiri na onwere ihe nwereike ime ebe ahụ. Ọ bụ PW ka gọọmentị nyere ikike ịrụ ọrụ okporoụzọ ụgbọelu si efepu na-efedata. Ndị ọzọ ji ọrụ ebe ahụ bụ ụlọọrụ ndị Chaịna bụ ndị CCECC, bụ ndị asịka ga-enwete ụme ha ga-eji kwanye ọkụ n'ọrụ ha. CCECC na-arụ ụlọ Bekee kpọrọ ""International Terminal"". Ya bụ ụlọ anọọla ọdụ kamgbe amalitere ịrụ ya. Ebumnuche ndị mmadụ bụ na PW ga-awụchị ọdọ ụgbọelu ahụ maka mmalite ọrụ taa apụtaghị ihe maka onweghị onye ọbụla dịka onye ụlọọrụ ahụ ahụrụ maọbụ nụ olu ya. Ndị ọrụ gọọmentị nọ ebe ahụ sị na nke a abụghị na ọrụ agaghi ịmalịte ọsọ ọsọ. Otu onye achọghị ka ekwuo aha ya sị; ""Ọ ka bụ ụnyaahụ ka Minista bịara ebe a sị ka ọrụ malite."" ""Unu bịa ebe a Monday unu ga-ahụ ndị ọrụ ọfụma"" Tupu BBC Igbo zọpụ njem n'ụtụtụ taa, ozi batara bụ na PW malitere ịbụga akụrụmgwa ọrụ ha a ga ọdọ ụgbọelu ahụ kemgbe izuụka gara aga. Onye ntakụkọ BBC enweteghị akwụkwọ Bekee kpọrọ ""Temporary Pass"" ga-enye ya ohere ịbanye n'ime ya bụ ọdọ ụgbọelu. Ọtụ onye na-arụ ọrụ na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ ""Federal Airports Authority of Nigeria"" (FAAN) achọghị ka e dee aha ya gwara BBC na ndị ọrụ abịara n'ezie. ""Ndị ọrụ PW na-abịa. Ngwa ọrụ ha dịka n'ime ""runway"". Ha si ụzọ Ọdọ ndịagha elu abata. Ya mere ndi mmadụ anaghị ahụ ha n'ebe a (""terminal building""). Ka ọ kwụ ugbua, BBC Igbo ga-eso akụkọ ịmata etu ọrụ si aga na etu o si kwụrụ." 44892827,https://www.bbc.com/igbo/44892827,Ndị ojiegbeezu awakpoola ebe obibi n'Ọnịcha,"Ndị ojiegbeezu a na-amaghị ndị ha bụ ruru mmadụ 20 wakporo otu ebe obibi ndị mmadụ n'Ọnịcha, Anambra steeti taa bụ Tọọsde ma gbuo otu onyenche ha.","Ndị omekome ahụ merụkwara otu onyenche ọzọ ahụ. Otu onye hụrụ ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na oge ndị omekome ahụ batara ogbe ebe obibi ahụ, ha chụwara ndị nche ha ọsọ na-agbakasị egbe rue mgbe ha gbaturu otu onye ma gbuo ya. Otu onye gwara ụlọntaakụkọ 'Thisday' na a chọtara ozu otu onye nche aha ya bụ Friday Atta oge ndị oji egbe ahụ lara ebe onye ọzọ bụ Uche Kalu gbajiri ụkwụ abụọ na ukwu ya. N'okwu ya: ""Ebe a dịka ebe a na-alụ ọgụ oge na-adịghị anya. ""Ndị omekome a ji ụdị egbe dị icheiche we bịa, a hụrụ m Ak 47 mana ndị nche anyị ejighi ngwọagha ọbụla maka na a gwala ha ejizila egbe. Ọ gara n'ihu kwuo; ""Anyị nọ na nsogbu n'akụkụ ebe a anyị bi, agụlighi m ndị meruru ahụ mana ama m na ha karịrị mmadụ 20. ""Nke abụghịkwa mbụ ndị a na-awakipo anyị ebe a."" Onyeisi ogbe ahụ bụ Uche Okeke gara na nke ndị uweojii n'Ọnịcha ime mkpesa ebe ọ gwara ndị ntaakụkọ na nke a bụ ugbo atọ ndị a na-awakpo ha."" O kwuru na ha na-ebi n'ụjọ kamgbe ha kwabatara ebe ahụ; ""Anyị zụrụ ala site n'obodo Umuonuorah Amuche dị na Nkwelle Ezunaka mana kamgbe afọ 2014 na 2015, ndị ntorobịa si Osile na-enye anyị nsogbu na ha nwe ala ahụ. ""Anyị agwala ndị anyị gọrọ ala ahụ n'aka ha, ha egosi anyị ikpe ụlọikpe kachasị ukwu kpere iji kwuo na ala ahụ bụ nke ha na-abụghị nke ụmụntorobịa anụ ma kwuo ka ha kwụsị imekpa anyị ahụ kama ha gakwuru ndị rere ala ahụ."" O kwuru na ha edegarala kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ akwụkwọ site n'aka onye ọkaiwu ha mana enwebeghi mgbanwe. Ha rịọrọ ka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris gbatara ha ọsọ enyemaka ka ndị uweojii n'Anambra jide ndị ahụ ma maa ha ikpe. Mbọ niile BBC Igbo gbara inweta ndị uweojii Anambra dị ka mmiri a wụrụ n'okwute. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53239579,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53239579,Coronavirus Update: Lee ihe ga-agbanwe ma e bido njem site steeti gawa steeti ọzọ,Gọomentị ekwuola etu njem ụgbọala n'etiti steeti ga-esi adị. Ọ bụ na mgbasa ozi nke ngalaba nzụkọ presidemtial Task Force kwuru na-ewepụla mmachi njem site otu steeti gawa ọzọ.,"Dịka gọọmentị wepụrụ mmachi ngagharị dị n'etiti steeti na steeti ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ihe chere ha mgbe ha ga-eme njem okporoụzọ. Njem ime steeti agbanwela dịka ndị ụgbọala na-ebuzi nanị 50% iha ha na-ebu mbụ Onyeisi ngalaba 'Risk Communication' nke 'National Centre for Disease Control bụ NCDC n'aha ịchafụ bụ Disu Yahya Oyewoga gwara BBC Igbo ihe ndị ga-agbanwe na njem ụgbọala n'etiti steeti. Ha gụnyere : Oyewoga kwukwara sị ""ngalaba NCDC, nzụkọ Presidential Task Force (PTF), Ngalaba FRSC na ndị nille nwere aka na njem ụgbọala na-enwe nzụkọ iji tule etu ha ga-esi mee ka iwu njem ụgbọala n'etiti steeti nwee isi"". Ọ kọwakwara na ha ga-enwe nzụkọ a kwa mgbe iji hụ na njem ụgbọala n'etiti steeti ga adị mma. Oyewoga kwukwara sị ""anyị na-enwe kwa nzụkọ ka anyị bipụta atụmatụ ga-eme ka mmadụ niile ghọta usoro njem ụgbọala"". Kedu ihe atụmatụ a nwereike ibute? Otu ihe nwereike ime dịka ndị ngalaba nọrọ onwe na-achịkọta njem ụgbọala na Naijrịa bụ National Union of Road Transport Workers ekwuola na ọ bụrụ na gọọmentị ewepụtaghị ụzọ ha ga-eji nyere aka na ha ga-ebuli ego njem ụgbọala. Ngalaba a na-akọwa na ọ bụrụ na ha ga-ebu nanị mmadụ passentị iri ise pekarịa ihe ha na-ebu mbụ na ha kwesiri ibuli ego njem ha ka ha nweta uru. Ego ndị jị ụgbọala eme njem n'ime stteti dịka Legọs arịala elu I ji maa atụ, mgbe ewepụrụ mmachị ngagharị n'ime steeti, ndị ọkwaa ụgbọala na-ebubu mmadụ anọ n'oche ma naa ha N300 were si Ajao Estate ruo Obalende kama ma dịka ha tinyere atụmatụ nchekwa coronavirus, ha na-ebuzi mmadụ abụo n'oche ma na-anazị ha N500. Otu onye na-arụ n'ụlọọrụ na-eji ụgbọala ebu ndị mmadụ site na otu steeti gawa ọzọ kwuru na ha agaghị ebido ọrụ ozugbo tupu ha atule etu ya bụ atụmatụ ga-esi metụta ọrụ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-45207601,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45207601,Nwoke 'kọnji' ji edinaala nwunye ya n'ụlọọgwụ.,Otu nwoke edinaala nwunye ya n'akwa orịa n'ebe a na-elekọta ụmụnwaanyị ya na-ejighị ahụ n'ụlọọgwụ.,"Mmegbu sị n'aka dị a bia na-abụkarị isi okwu na Mba Africa Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị nọ n'ime ebe ahụ ihe mere rụrụ iri n'ọnụọgụgụ. Ihe a mere n'ụlọọgwụ dị na mba Zimbabwe dika ndị ụlọọrụ mgbasa ozi a kpọrọ ''iHarare News'' si depụta. Nwoke a, dika akụkọ si kwuo, mibanyere n'ime ya bụ ụlọọgwụ ga dina nwunye ya. iHarare News depụtara na nwoke a, a ma ama dịka onye nwere ụlọ oriri n'obodo ahụ na ndị nọọsụ nwere ndọrọndọrọ maka ya ịhụ nwunye ya onye ahụ adịghị. Dibia Bekee nwe ụlọọgwụ ahụ bụ Amadeus Shamu kwetere n'ihe a mere kwuru na ọ bụ mkpọtụ di na nwunye a mere mgbe ha na-emekọ ka ndị nọọsụ jị wee gbata ọsọ kpọọ ndị nchekwa bịara dọpụta nwoke ahụ ebe ahụ. Nwunye nwoke ahụ kwuru na ọ bụru na o kweghị ka di ya dịna ya, o ga-eti ya ihe. N'okwu nwunye ya, ""ọ bụrụ na m emeghị, di m ga-eti m ihe n'ihu ụmụnwaanyị a maka na ọ na-etikarị m ihe oge ọbụla.'' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-49789305,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49789305,Chelsea vs Liverpool: A gbariela akwammiri 'Stamford' ndị Chelsea,'Ogologo abụghị na nwa m etoola' bụ ihe Liverpool gwara Chelsea na 'Stamford Bridge' n'asọmpi Premier League.,Ha mere nke a site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha n'ime ụlọ ha nakwa n'ihu ndị nkwado ha. N'ime ọkara nke mbụ na nkeji 14 ka Trent Alexander-Arnold nke Liverpool ji 'Free kick' nye goolu mbụ. N'otu aka ahụ Roberto Firmino ji isi ya makpuo goolu nke abụọ n'ime neetị ndị Chelsea na nkeji 30. Chelsea nwara ike ma nye ndị Liverpool otu goolu n'ime nkeji 71 site n'aka N'Golo Kante. Chelsea gara n'ihu sie ọnwụ na ngwụcha asọmpi a ka ha nyere goolu mana Liverpool kere ezigbo nkwụcha. Merie Liverpool nwetere bụ nke isii ha n'asọmpi isii ha gbarala na Premier League nke afọ a. Liverpool bụ ndị mbụ ebe Chelsea bụ ndị iri na otu n'ogogo tebụlụa Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-56521427,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56521427,Anyị amaghị maka ogbugbu mmadụ ọhụrụ sitere n'esemokwu Ezza na - Ndị Uweojii,Ọnu na-ekwuru ndi uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Ọdah ekwuola na ha amaghị maka ogbugbu mmadu ọbụla mere na esemokwu dị n'etiti ndị Ezza na ndị Effium.,"Odoziakụ Odah kwuru nke a ka ọ na-aza ajụjụ BBC Igbo banyere akụkọ pụtara na esemokwu ahụ na na-abawanye dika ọ ""tara isi nwaanyị dị ime na mamdụ 16 ọzọ"". Anya si na ya hụrụ ihe a sịrị na mkpa mkpa kpara n'obodo Effium n'ubọchị Wenezde dịka ọ kụru elekere asatọ nke abalị. Mana Odah si na dịka ha siri mara, obodo abụo ahu adaala juu dịka gọọmneti wepụtere aha ndi na-enye nsogbu n'ebe ahụ. ""Anyị gara nzukọ ebe anọ wepụta aha ndị na-ebute nsogbu ma si ka anwụchie ha. kemgbe ahụ, udo adịla n'obodo abụọ,"" bu ihe Odah gwara BBC. Onye ntaakụko BBC nọ n'Ebonyi zitere akụko dịka o jiri site n'ọnụ otu onye agha achọghị ka ekwuo aha. Ọ sị na nsogbu malitere oge ndị Ezza na ndị Effium zutere iji họpụta ndị ga-esonye n'otu udo dịka gọọmnetị Ebonyi siri sị ka ha mee. Onye agha a siri na egbuwara nwaanyị ahụ di ime isi ma gbukachaa ya ahụ. Ọ sị; ""Ọ bu dịka isi obodo abụọ a nọ na-eme nzukọ iji họpụta ndị otu udo ka otu mpaghara n'ime ha malitere ikwu na ndị si mpaghara nke ọzọ na nke ha. Ọ bu ihe butere ogbugbu mmadụ a."" Onye agha si na ha amaghi obodo nke malitere okwu a. Ọ gakwara n'ihu kwuo n'obodo Effium ka na-agba ọkụ ugbua. “Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila(Benue) na Ngbo(Ebonyi) bụ itinye oke-ala”...Chairman Ohaukwu LGA Ọ sị; "" Ihe chọrọ ikwu bụ ndị isi obodo ndị adaala. ekwesiri ịnwụchi ha nille kpụpụ ha ụlọ ikpe. Ma ruo ugbua ụfọdụ ụlọ ka na-agba ọkụ. Ọ sị na ndi ntoroọbịa bu nwaanyi ahụ gawa ụlọọgwụ dị nso n'oke ala Ebonyi na Benue steeti, mana tupu ha eruo, nwaanyị ahụ anwụọla. Onye aghabara mba maka ihe ha hụru na ya bụ obodo. Ọ kwuru sị; ""Ihe a ekwesighi ma ncha. Leezianu igbu nwaanyị dị ime. Onye ọbụla gbajọrọ nke ahụ. I kwesiri ị bịa hụ etu ozu siri ju n'obodo ahụ niile ụnyaahụ. Ọ bụrụ maka esemokwu maka onye ga-abụ onyeisi ọdọ ụgbọala."" Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ ọkaiwu Uchenna Orji gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde na gọọmentị steeti ahụ ga-akpọghachite ndị isi ha sepụtere n'obodo ndị a maka ịmalite ikpe udo ọzọ. Mkpa mkpa kpara dịka ọ mechara otu ụbọchị ndọ obodo a binyere aka n'akwụkwọ maka udo n'obi gọọmentị dị n'Abakiliki." 43608308,https://www.bbc.com/igbo/43608308,"Akụkọ kachasị taa: Ndị agha Naịjirịa na Boko Haram, akụkọ sịrị Imo na Sierra Leone",Ndị agha Naịjirịa agbagbuola ndị agha Boko Haram anọ,Akụkọ kachasị taa Ndị agha Naijiria ka na-ebuso ndị Boko Haram ọgwụ Ndị agha Naịjịria ekwuola na ha gbagburu ndị agha Boko Haram anọ n'obodo Malumti na-adighị anya ohịa Sambisa. Ha kwakwura na ndị agha Naijiria nwakporo ndị agha Boko Haram oge ha na achọ nrị na mmịrị na obodo ahụ. Ndị uweojii na-atụ ndị otu nzizo aka na ogbugbu nwata akwụkwọ a Ndị uweojii na Imo steeti ekwuola na ọ bụ ndị otu nzizo bụ ndị gbagburu nwata akwụkwọ ahụ akpọrọ Kelechi Ibe na mahadum steeti ahụ. Ndị uwe ojii na-ekwe nkwa na ha ga jiri ndị mmere ihe a Ibe bụ nwata akwụkwọ na-eme mmemme nlote ụbọchị amụrụ ya oge ndị a batara gbagbuo ya. Ha kwuru na ugbua aka na achọ ndị a mere omume a. Onye ga-emeri na ntụlịaka Sierra Leone? Ala Sierra Leone na-eme ntụlịaka taa maka ị họpụtara onye ga-abụ onye isi ala ha ọhụrụ. Ndị Sierra Leone ka na-atụ anya onye ga-emeri na ntuliaka a Cheta na a kwusịrị mbinyeaka a na mbido onwa a maka ebubo na ntu na aghọghọ abagọ na yabụ mbiyeaka. Ọ bụ Julius Maada na Samura Kamara bụ ndị na-azọ okwa ọchịchị ugbua. N'akụkọ egwuregwu Onye ga merị na mgba nke a? Anthony Joshua na Joseph Parker ga-asọ mpi n'egwuregwu ịkụ ọkpọ taa n'ime Principality stadium na Wales n'abali taa. Joshua bụ nwaafọ Naịjiria bụkwa onye mba Britain bụ oka mgba na mba uwa na egwuregwu ịkụ ọkpọ. Nkeji nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile 42810088,https://www.bbc.com/igbo/42810088,Gọọmentị Buhari enyela Obasanjo ọsịsa edemede o dere,Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed asala edemede nke Obasanjo degara Buhari n'ụbọchị abụọ gara aga site na ị gụsị ihe ndị gọọmentị mere n'afọ atọ gaara aga.,"O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya. Ihe ndị ọ gunyere bụ ibuso mpụ agha, ịkwalite ọkụ latrik, ịtụgharị akụ na ụba ala Naịjirịa na ịweta ọrụ dị iche iche n'obodo . O kwuru na onwere ike, 'Obasanjo amaghị ịhe niile gọọmenti na-eme n'ihi na o nweghị ohere'. Abali ole ma ole gara aga onye bụbu onye isi ala bụ Olusegun Obasanjo degara Muhammadu Buhari edemede kwa ya na ikpa oke na etinyeghị uchu na ọrụ emela ka ọghara ime ọfụma na ịkwalite akụ na uba Naijiria. Obasanjo degara Bụhari kwa ya ka ọ ghara ịzọ ọkwa ọchichị n'afọ 2019 Ka nke a na-aga, onye na-ekwuchite ọnụ otu nọ n'ọkwa ọchịchị, APC na Lagos bụ Joe Igbokwe gwara BBC na onweghi oge Buhari kwupụtere na ọ ga-azọ ọchịchị onye isi ala na ntụlịaka nke afọ 2019. ""Buharị ga-arụ ọrụ Chineke zigara ya ka ọ rụọ n'isi."" Ọ si kwa na Buhari ga-ejisike ịgba mgba megide mpụ na ezumohi na-aga na Naịjirịa. Tupu Mohammed zaghachiri edemede nke a, Obasanjo na-ewu n'elu igwe okwu Twita: Ihe butere nke a bụ edemede o degara Buhari na-adọ ya aka na ntị maka ọnwụ ndị mmadụ n'aka ndị ọchị ehi." afirika-43042533,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43042533,Imo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr?,Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ ga-akwado ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu maọbụrụ na ọ pụta ịzọ ọkwa ọchịchị govanọ nke Imo Steeti n'afọ 2019.,"Rochas mere nwanne ya nwaanyị onye Kọmishịọna na-ahụ maka obi ụtọ nke Imo Steeti O kwuru nke a mgbe ndị otu Pati APC n'akwa ndị ọzọ si na mpaghara Owerri Manucipal bịara n'obi ọchịchị ya dịna Owerri gwa ya ka ọ kwadọ Uche Nwosu ịzọ ọkwa Gọvanọ Imo Steeti n'afọ 2019. Gọvanọ kwuru na Uche Nwosu agwabeghi ya na ọ chọrọ ịzọ ọkwa Gọvanọ, ma kwuo na ọ ga-akwado ya mgbe ọbụla ọ dị na njikere ịzọ ọkwa Gọvanọ. Ọ kọwara ya dịka onye ezịokwu na-adịghị akpa oke ọ bụla. ""Uche bụ onye na-etinye uchu n'ọrụ ike adịghị agwụagwụ, ọ bụ nwoke dị umeala, ọ na-aghị akparị mmadụ."" Akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị Imo Steeti na-akwadọ onye osote Gọvanọ bụ Prince Eze Madumere ka ọ bụrụ onye ga-anọchị anya Rochas n'afọ 2019. Cheta na izuụka gara aga, Onye bụbụ Gọvanọ Imo Steeti bụ Ikedi Ohakim kwuputara uche ya n'ịzọ ọkwa ọzọ n'afọ 2019. Ebe ọkatọrọ Okorocha maka iji ndị ọkaikpe Imo Steeti ọtụtụ ọnwa. Imo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr? Mgbe ndị BBC gbara otu onye ọka n'okwu ndọrọndọrọ ọchichi bụ Obi Joe ajụjụ ọnụ. Okwuru na Okorocha nwereike ịkwado onye ọbụla ọchọrọ maka ịzọ Gọvanọ na ihe ndị Imo chọrọ bụ onye ga-achị nkeọma. O kwukwara na ọ bụrụ Uche Nwosu, Eze Madumere, Ikedi Ohakim maọbụ ndị ọzọ pụta ịzọ ọkwa Gọvanọ na ọ dị ndị Imo Steeti n'aka ịhọpụta onye ha chọrọ. Joe kwuru na dịka ihe ụdị mkparịta ụka otu pati dị icheiche n'enwe ugbua, na ọ dịka agha onye ga-abụ Gọvanọ Imo Steeti n'afọ 2019 amalitela." afirika-43341171,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43341171,Ndị uweojii Enugwu anwụchiela nwoke gburu nwunye ya,"Otu nwoke a kpọrọ Sunday Nnamani akụgbuola nwunye ya, n'Enugwu, Enugwu steeti.","A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya Akụkọ kwuru sị na izụụka gara aga, Nnamani na nwunye ya bụ Nkechi nwere nghọtahie ebe ọ nọ kunye ya ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma. E bugara ya n'ụlọọgwụ Parklane Specialist Hospital, Enugu, ebe ọ nọrọ na-enwe nleta tupu ọ nwụọ ụnyaahụ. Mgbe BBC gbara ya ajụjụọnụ n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ SP Ebere Amaraizu, kwuru n'ezie na ọ bụ ihe mere eme. ""Ọ bụ eziokwu. Mana ọ bụ izuụka gara aga ka nwoke ahụ na nwunye ya nwere okwu o were ihe kụọ ya n'isi. E buga ya ụlọọgwu ma ọ nwụrụ ụnyaahụ."" Amaraizu gara n'ihu kwuo na aka ndị uweojii Enugwu steeti akparala nwaamadi ahụ, ebe o sokwa enyere ha aka na nyocha ha na-eme maka ọdachi ahụ. Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu." afirika-50873637,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873637,Kano Hisbah: Ganduje kwụsịtụla iwu machiri nwoke na nwaanyị ịnọkọ na keke,Gọọmenti Kano steeti aracharala ihe ha gbọpụrụ dịka ha kwusịtụrụ iwu machiri nwoke na nwaanyị ibanye otu keke.,"Onyeisi otu ndị uweojii Sharia na steeti ahụ bụ Sheikh Harun Ibn-Sina onye kwupụtara nke a kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka a kpa ya akpaa tupu e tinye ya n'ọrụ. Cheta na ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ atụmatụ ahụ oge e kwupụtaburu ya. Lee ihe ụfọdụ kwuru na Facebook BBC Igbo maka ya bụ atụmatụ: Content is not available End of Facebook post, 1 Kano Hisbah: 'Iwu keke ọhụrụ naghara m ịga ọrụ n'oge' Otụtụ ndị bi na Kano jikwara eze kpee ekwere dịka iwu ahụ pụtara ihe. Elizabeth Sabis bi na Kano akwaala arịrị gbasara etu iwu ọhụrụ ewebatara na Kano si emetụta ya. Sabis gwara BBC Igbo na iwu a mere ya ka ọ ghara ịga ọrụ n'oge n'ụtụtụ n'ihi na ndị Keke bu nwoke ekweghị akwụsịrị ya. O kwuru sị ""e chere m ọtụtụ oge tupu m hụ keke ebụghị nwoke m bara nke kpatara na m erughi ụlọọrụ m n'oge"" Cheta na otu Hisbah na Kano bụ ndị na-elekọta iwu Sharia na steeti ahụ ga-ebido ịda onye keke bukọrọ nwoke na nwaanyị otu mgbe. Ha kọwara na iwu a adịla kemgbe afọ 14 gara aga mana ugbua ka ha ga-etinye anya na ya ọfụma. Ihe ndị ha ga-ada ndị mmadụ bụ: ị jichi keke onye ahụ rue ọnwa isii, ị da ya nha naịra puku ise nakwa ụtali iri. Ndị mmadụ dịka Edward Onoride katọrọ emume a na-ajụ ma Hisbah a ga-egbochi nwoke na nwaanyị ịbanye otu ụgbọelu? Kano steeti malitere ị so iwu Sharia kemgbe afọ 2001." afirika-48839348,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48839348,Nigeria vs Cameroon: 'Super Eagles' ga-ezute 'Indomitable Lions',Ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ga-ezute ndị ogbo ha nke mba Cameroon a na-akpọ 'Indomitable Lions' n'agba nke abụọ nke AFCON 2019.,"Akụkọ ndị dị mkpa ụbọchị Tuuzde, Julai 2: Eric Maxim Choupo-Moting nke Cameroon na Wilfred Ndidi nke Naijiria Asọmpi a ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị Satọdee abalị isii nke ọnwa Julai 2019 ma ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi. Mgbe ndị otu egwu bọọlụ Nigeria zutere ndị Cameroon nke ikpeazụ bụ mgbe ha sọrọ mpi n'afọ 2018 iji ma ndị ga-eso gbaa iko mba uwa na Russia. Naijiria ji ọkpụ goolu anọ asataghi asata merie Cameroon na Uyo, Akwa Ibom steeti, ebe ha nyerịtara onwe ha otu goolu otu goolu na Yaounde. Orji Uzo Kalu so na ndị ọrụ Ụlọomeiwu Ukwu a họpụtara A họpụtala ndị ga-enye aka ịchịkọta Ụlọomeiwu Ukwu ndị gụnyreere aka chịburu steeti Abia bụ Orji Uzor Kalu bụ onye a họpụtara dịka 'Chief Whip' Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bu Ahmad Lawan nọrọ n'ọgbakọ nke ndị omeiwu ahụ nwere n'ụbọchị Tuuzdee wee kpọpụta ha. Ụkwụ Mikel apụọla n'Afcon? Akụkọ si mba Egypt na-ekwu na Mikel Obi agaghị eso na agba nke ọzọ nke AFCON 2019 n'ihi ahụ o merụrụ mgbe Super Eagles Zutere Madagascar. Mikel merụrụ ahụ n'ikpere na asọmpi Naijiria na Madagaska tupu e webata Alex Iwobi ka ọ nọchie ya na nkeji 59. Ka ọ dị ugbua, a na-atụ egwu na Mikel nwere ike ọgaghị agbakecha nke ọma tupu AFCON ahụ agwụchaa nke pụtara na ọ gaghị esokwa na gbaa bọọlụ ọzọ. Mikel ekwubuola na asọmpi nke afọ a nwere ike ịbụ nke ikpeazụ ọ ga-esonye na iko mba Afrịka. 'Buhari ewepụtaghị aha ndị mịnịsta' Ụlọọrụ onyeisiala Naijiria agọọla na akụkọ na-efegharị na onyeisiala Buhari ewepụtala aha ndị Mịnịsta ya bụ asị ọcha. Ọnu na-ekwuru Buhari bụ Garuba Shehu kwuru n'akụkọ dị otua esighi n'aka ya pụta. Mouad Bouchareb achịsala ọwa N'ofesi Onyeisi ụlọmeiwu mba Algeria bụ Mouad Bouchareb etinyela akwụkwọ arụkwaghịm dịka ngagharịiwe na ọgbaghara na-aga n'ihu maka ọnọdụ obodo ahụ. Ndi na-eme ngaghariiwe chọrọ ka ndị ọchịchị obodo ahụ nile rituo ma gaa zara ọnụ ha n'ụlọikpe. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe ruru mmadụ 50 anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ Tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'obodo Ahumbe n'ụzọ Alliade - Makurdi n'okpuruọchịchị Gwer East nke Benue steeti ebe ha chere na ọtụtụ nwụrụ, dịka onye hụrụ ihe mere sịrị kọọrọ ndị ntaakụkọ. Ndị uweojii gwara BBC na mkpamkpa a mere n'elekere abụọ nke ehihie na Mọnde n'ụbochị Julaị nke mbụ, 2019. Ọgọ Buhari apụtala n'aka ndị ntọ A tọhapụla Magajin Garin Daura, Alhaji Musa Umar Uba, n'aka ndị tọọrọ ya ka o mere ọnwa abụọ n'aka ndị ntọ. Ndị otu isiekweọnwụ ndị uweojii a kpọrọ 'IGP Intelligence Response Team'(IRT) azọpụtala Alhaji Musa Umar Daura Magajin Garin Daura nke Katsina Steeti n'aka ndị ntọ. A tọrọ nwaamadị ahụ kemgbe abalị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2019. Ndị ntọ ahụ tọọrọ ya bụ Eze obodo n'obodo ya na Kastina. Etu nwoke akpọrọ ""Nigeria's Supercop"" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa. Site na ntuziaka IGP Adamu Mohammed, ndị otu IRT nke onye ndu ha bụ Abba Kyari ji izu isii maa imi n'ala site na enyemaka ndị OC SIB Kaduna nakwa nke ndị Niger steeti ịchọta ya bụ Eze Obodo atọọrọ. Ndị a mara imi n'ala ka nkịta chọwa Eze a ọhịa na ụzọ niile dị na Kaduna, Bauchi, Niger, Katsina, Katsina na Kogi Steeti bụ ebe ha nwụtara ndị omekome iri na otu nke gunyere onyeisi ha mazọpụtakwa Magajin Garin Daura n'akụkụ Panshakara dị na ime obodo Kaduna n'isi ụtụtụ taa bụ abalị abụọ nke ọnwa Julaị. Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa Otu isi onye ntọ nara na ya bụ oke mgbọ ndị uweojii a kwara nke mere eji zọpụta ya bụ onye Eze. A napụtarakwara ha ọtụtụ egbe AK47 na mgbọ mgbe anwụchiri ọtụtụ n'ime ha. Ihe karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ Ọkwa ụgbọala 'Awụbara m n'ọwa mmiri iji gbanarị ọkụ ahụ' Ndị akaebe kọwakwara na ọ bụ mgbe ụgbọala ahụ chọrọ ize olulu dị n'okporo ụzọ ka ọ dara ma wusie ihe mmanu ụgbọala o bu n'okporo ụzọ. Ka mmanụ a wasara n'ụzọ, ụfọdụ ndị obodo Ahume pụtara na-ekuru mmanụ a ka ọ na-awụpụ. Ha kwukwara na ọ bụ otu onye ọkwụ ụgbọala gbafere mụnyere ha ọkụ. Ụmụagbọghọ si akwụna n'ofesi lọta na-eti eti n'ụlọ - UK Home office Ụmụ mmadụ awụọla UK Home office ọnụ maka ịkwụ na ụmụagbọghọ sị Naịjrịa na-agbaga ofesi maka ịgba mbarama na-egosi nnukwu akụ na ụba ma ha lọta. Kate Osamor bụ omeiwu na mba Uk sị na Home Office agbagheghị ahụhụ ụmụagbọghọ ahụ na-ata were kwuwe ụdị ọkwụ ahụ. Achụọla Usman Yusuf na NHIS Eboro Usman Yusuf ebubo ndekwuru nde N'ikpeazụ, onyeisiala Mohammadu Buhari achụọla onyeisi National Health Insurance Scheme bụ Usman Yusuf ọnwa asaa kọmiti ehibere maka ịnyọche ya bụ nwaamadị kwụru otu ahụ. Onyeisiala ewerelarị Mohammed Sambo dochie Yusuf bụ onye eboro ebụbụ ịmemina nde kwuru nde naịra. Abụbụọrụ ọzọ esiwela Ndị otu Joint National Public Service Negotiating Council na ndị ọgbakọ otu ọrụ asatọ ọzọ efolara ntutu taa na ha ga-amalite abụbụ ọrụ ma gọmentị ebidoghị ụgwọ opekatampe ha kwere na nkwa. Onyeisi ndị otu a bụ Anchaver Solomon sị na ha amalitela ịkpọkụ ndị otu ha na steeti niile maka nke a iji hụ na pụkụ iri atọ gọmenti kwetere bịara na mezu mgbe adịghị anya. Nwoko zoro n'ụgbọelụ anwụọla N'ofesi ozu otu nwoke eche na ozoro na kenya Airline adapụla na Heathrow Airport na London. A na-eche na ya bụ nwoke amatabeghị onye ọ bụ zubara na ya bụ ụgbọelụ na Nairobi, kenya dịka ndị uweojii mba ahụ kwuru. Venus Williams ebiela aka n'ala N'egwuruegwu, nwatanta ekponyela Ezenwaanyị tenis, Venus Williams aja n'ọnụ. Cori Gauff gbara afọ iri na ise meriri Venus Williams jigoro tenis riwe ihe tupu amụọ ya n'afọ 2004 asọmpị ha na Wimbledon nke 2019. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Onye ọja Gerald Eze Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44882481,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44882481,Ndị Igbo a ga-ege Ipob nti maka ntuliaka 2019?,BBC Igbo gbara ndị mmadu ajụjụ ọnụ maka ntuliaka 2019 iji chọpụ ma nke na-eme n'ala Igbo nakwa etu ndị mmadụ ga-eji saa mkpebi Ipob maka ntuliaka 2019.,"Ndi Ipob na ntuliaka 2019 Onye ji egoachụego n'Aba bụ Chidiebere Ikeh gwara anyị na ike Ipob adịghịzị ka ọ dị na gboo, ma kwuo na ndị Ipob ya ma na-agbata akwụkwọ PVC. ""Ọtụtụ n'ime ha na-akwodo Eyinnaya Abaribe, nke mere ha ji na ahazi ịtụnyere ya na ntuliaka nke 2019,"" Ikeh gwara anyị Gee ya ntị n'uju n'elu. Onye ọzọ anyị gbara ajuju ọnụ bụ Ọgụeri Ishiguzo bu onye otu pati APC n'Imo steeti. Ishiguzo si na yabụru na ọ bu Ohaneze ndị Igbo wepụtara atụmatụ a, ndị Igbo ga ege ntị, ma kwuo na Ipob enwerezi udiri ikike ha nwere na mbụ. Gee ntị ihe ọ gwara anyi ebe a: Ishiguzo gwara BBC okwu Cheta na otu na-achọ ka ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kewapụ ma bụrụ mba akpọrọ Biafra bụ Ipob agwala ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, ndị etiti Naịjirịa nakwa ndị ndịda mba ahụ ka ha ghara isoro mee ntuliaka nke afọ n'abịa. Ipob kwuru nke a, n'ime akwụkwọ ozi onye mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful zipuru ụnyaahụ, ebe ha sị na nchịkọta otu ruru otu nde aghaghị akwụsịnwu onyeisiala Muhammadu Buhari imeri ntuliaka 2019. Ipob ka na-ewe iwe maka egwu eke ndi agha Naijirịa mere n'Abia steeti Powerful kwuru n'ime akwụkwọ ozi ahụ na ""onweghị mgbe ntuliaka na-ewepụ onyeisiala aka ike n'ụwa"", bu ihe mere o kwuo na ọ bụ naanị ịkwụsị ike n'ekweghi ekwe na-ebutu ha. N'okwu Powerful, ọ sị na ihe Ipob na-eme ugbua bụ ihe ha kwesiri ime, nke bụ ha inweta nwereonwe nke ha, bụ nke ọ sị ga-ebute mkpebi ihe niile dị njọ na Naịjirịa. Enweghị ọgbaaghara na ntuliaka Ekiti steeti, mana akụkọ kwuru na-egoro ma rekwa vootu ""Ya bụrụ na ndị na-anọghị n'ọchịchi chọ, ha chịkọta otu ruru nde chọrọ ichutu APC, Buharị ka ga-emeri. Makana nchịkọta APC, Inec, ndị agha, Civil Defence na ndi uweojii ka otu ndị ọzọ niille ahụ ike, Ihe ka mma bụ ịghara iso na ntuliaka ọbụla. ""Anyị bụ Ipob na-asị ka aghara ime ntuliaka n'ala Biafra, etiti Naịjirịa nakwa ndịda Naịjirịa niile, maka na ọ bụ sọsọ etu a ka a ga-esi chekwa ndụ ndị mmadụ, kwụsị ahụhụ a na-ata ma enweta udo."" Powerful gakwara n'ihu tinye ọnụ na ntuliaka nke emere na Ekiti steeti n'ime izuụka gara aga, nke ọ sị kwadoro ihe ha na-ekwu. Cheta na ụlọikpe na Naịjirịa kagburu ma sị na iso na Ipob bu ihe iwu megidere na afọ 2017. Ahụbeghi onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu kemgbe ndi agha wakporo be nna ya kemgbe September 2017. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53462090,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53462090,Big Brother Naija Season 5: Ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'ụbọchị mbụ ọ malitere,"Dịka a malitere Big Brother Naija nke agba ise a kpọrọ ""Lockdown"", e nwere ike ndị nọ n'ime ụlọ ahụ amaghị na ha emetela ihe ndị ha ji ewu n'elu soshal midia.","Dịka ha batachara ma kwuputechaa aha ha na ihe e ji mara ha gụnyere ụdịrị ihe ha chọrọ na nwoke maọbụ nwaanyị ha na-ayị, ha kwukwara ụdịrị ihe ha na-atụ anya ga-eme mgbe ụbọchị 71 ha ga-anọ n'ime ga-abịacha laa. Ndị dị ka Laycon bụ otiegwu, Dorathy, Nengi, nakwa Ozo, ka ndị mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe ha tụrụ ụkwụ n'ime ụlọ ahụ. Ihe mere ha ji ewu: 1) Laycon: Site n'oge o yi uwe na-enwu ọkụ pụta n'ebe Ebuka Obi-Uchendu bụ onye nchịkọta ya bụ emume na-anabata ya, ruo ka o kwuru na ịkpa maka mmekọ nwoke na nwaanyị masịrị ya, ọtụtụ ndị mmadụ gụfuru ya. Ha sị na enweghi ihe ọ chị, ụfọdụ che na o kweghi ekwu okwu n'ihi na ""ọ maghị asụ Bekee"", ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ maka na ọ hụtara onwe ya ka onye ndị ọzọ karịrị, mere o ji gbachi nkịtị na-ele sọsọ anya. Mana ka Laycon bụ otiegwu chọrọ iji ohere a kwalite egwu ya mepere ọnụ gụọ otu egwu ya, ọtụtụ ndị mmadụ echigharịala ma kwuo na ha ga-akwado ya. Ụfọdụ ndị otiegwu a ma ama gụnyere Reminisce, Sean Tizzle, Chinko Ekun, Oxlade adọnyekwarala ya ukwu. 2) Dorathy: Dorathy mere ka ọtụtụ ndị chefutu ọzụzụ nne na nna ha zụrụ ha site n'oge o zutere Ebuka, ma ruo oge ọ banyere n'ime ụlọ. Gịnị ka ha ji kpụrụ ya n'ọnụ? Ha hụrụ ara ya ma na-eti mkpu na o juru ebe niile, ọ bịara dịka ara ya o nweela ndụ nke naanị ya. Ọtụtụ ndị ọkachasị ụmụnwoke, kwuru sị na ha ga na-akwado ya n'ihi otu ihe a. 3) Nengi: Nengi ma na ọ mara mma tupu ọ bata n'ụlọ, mana ọ maghị na ọ bụghị mma ya ga-eme ka ndị mmadụ kpụrụgodi aha ya n'ọnụ. Dịka Dorathy, ukwu Nengi enweela ndụ nke ya, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ihe o bu n'ukwu bụ 'ebelebe'. Ihe ọzọ mere o ji ewu bụ na ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-atụ asị na ọ dị afọ 20 n'afọ a n'agbanyeghi na ọ sị na o so mee asọmpi maka nwaanyị kacha maa mma na Naịjiria n'afọ 2017. 4) Ozo: Ozo malitere iwu dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ mara ezigbo mma nwoke. Ndị mmadụ na-ekwu na Ozo nke ezigbo aha ya bụ Ozoemena ma na ọ mara mma, ma bụrụ onye ga-etinye obi ọtụtụ ụmụnwaanyị na nsogbu. Ihe ise gbanwere maka Big Brother Naija nke 2020 Big Brother Naija agba nke ise ga-amalite taa n'elekere asaa nke abalịMana ọrịa coronavirus emeela ka ụfọdụ ihe gbanwe gbasara ya bụ ejije. Onye ga-achịkọta ndị ga-eso na BBNaija nke 2020 ka bụkwa Ebuka Obi- Uchendu.Lee ihe ise ga-agbanwe na nke afọ a1.Ndị ọbia agaghị abatali n'ụlọ ebe a na-eme ya bụ ihe nkiri2. Ndị na-ekiri ha agaghị abịali n'ụlo ebe a na-eme ngosi ogo mwepụ na BBNaija3. A ga na-enyocha mkpọmọkụ ahụ onye ọbụla so eme ihe nkiri a kwa ụbọchị 4. A ga-eji disinfectant ehicha ebe ọbụla n'ime ụlọ ahụ tupu amalite mmepụta ihe nkiri mgbe ọbụla. 5. Ndị ọrụ ahụike ga-anọ ikwado ndị na-eme ya bụ ihe nkiri. Ihe nrite ga-eso ndị meriri na Big Brother Naija 2020 Ọtụtụ ihe bụ nke gbanwere maka Big Brother Naija nke afọ 2020, site na nhọpụta ndị ga-esonye e mere n'elu intaneti rakwa ihe nrite so ya. Onye ga-emeri agba nke ise a ga-eji ihe nrite ọnụ ego ya ruru nde naira iri asatọ na ise. Lee ka e si gbarie ya: Ndị hibere emume a kwuru na ha e nyochala ndị niile ga-eso me ya bụ ejije, dopu ha ruo izu ụka abụọ tupu a nabata ha n'ime ụlọ ahụ ebe a ga-eme ejije ahụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @KhamisAbdulrauf kwuru na ndị a họpụtara maka mmemme a na-enye ya obi ụtọ @ukwuchisom na-ekwu ya bụrụ na ahọpụtara ndị ọhụrụ a ọfụma makana ọ chọrọ ka agba nke 2020 kajaa akaja. Ụwa nwezikwa nkiri! Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44065588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44065588,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọdọ mmiri tiwara na mba Kenya egbuola mmadụ 120,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Otu na-ahụ maka ihe gbata gbata bụ Red Cross ekwuola na eburula mmadụ ruru iri atọ n'itoolu gaa ụlọọgwụ mgbe ọdọ mmiri tiwara n'isiobodo Kenya bụ Nairobi. Ọdọ mmiri ahụ tiwara site n'oke mmiri ozuzo gburu mmadụ otu narị n'iri abụọ 120. Naịjirịa Gọọmentị etiti adọọla ngalaba na-ahụ maka ahụike aka na ntị ka ha hie asaa n'anya kwadoo nkeọma maka ọrịa ebola anụrụ na ọ laghachitela na mba Congo. E kwukwara ka ha jisieke na-echekwa oke Naịjirịa maka i ji gbalahụ ọrịa a. Ebe ọzọ na Naịjirịa Onyeisi ndị uweojii na-elekọta ụlọ omeiwu Naịjirịa aha ya bụ CSP Sulu-Gambari Abdul ataala ndị nọ n'ime sineti ụta maka mwakpo e mere n'ụbọchị iri n'asaa nke Epurel. Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti Ọ sị n'ụfọdụ ndị sineti na ndị nchekwa so kpa nkata izu ọfọ n'imeụlọ sineti. Akụkọ mba ofesi Ndị mba Amerịka atọ mba Nọt Koria tọghapụrụ ekelela onyeisiala ha bụ Donald Trump nakwa onye odee akwụkwọ mba Amerịka bụ Mike Pompeo maka nwere onwe ha. Trump ekwuola na ihe a na-egosi ihuoma Nọt Koria bu n'obi ma kwu kwa na enwela ụbọchị na ebe ya na Kim Jong un ga-enwe nzụkọ. N'egwuregwu, Onye na-achịkọta bụ otu egwuregwu bọọlụ Manchester United bụ Alex Ferguson esila n'ọnọdụ nleta dị ọkụ pụta. Cheta na a wara ya isi nke gbata gbata maka ọbara na-agba ya n'ụbụrụ n'ụbọchị satọde. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa" afirika-53346217,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53346217,Waec 2020: Mmechi emechiri ụlọakwụkwọ mere ka ihe ọjụọ dị iche iche na-eme - Nwata Akwụkwọ Naịjirịa,"Ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi ha na nne na nna ha ekwuola uche ha maka mmachị amachịrị ụloakwụkwọ ụfọdụ iso lee ule WAEC.","Nke a na-eme dịka mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Mallam Adamu Adamu kwuru na enweghị nwata akwụkwọ nke SS3 na ụlọakwụkwọ akpọrọ ""Unity Schools"" ga-ele ule nke ""West African Examination Council"" (Waec) nke afọ 2020. Adamu gakwara n'ihu gwakwa ndị ngalaba ule Waec ka ha hapụ maka ule Waec nke afọ a. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ekwuputala uche obi ha, ọkachasị ndị chọrọ ile ule Waec. Ihe ụmụakwụkwọ nwere ikwu Ụmụakwụkwọ chọrọ ga-ebido agụmakwụkwọ Nwata akwụkwọ bụ Nwamadụ Ezinwanneakola bụ onye chọrọ ile ule Waec kwuru na ọ ka mma ka gọọmentị hapụ ha ka ha lee ule ha. Ọ rịọrọ sị ""kama ka enye anyị ohere mgbe anyị na-ele ule, onye dee chaa ya alawa"". O kwukwara na ụfọdụ ụmuaka na-echefu ihe ha gụrụ mgbe ha na-akwado ya bụ ule. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ BBC Igbo hụrụ n'ụlo akwụkwọ Practicing School nke dị n'Ezzamgbo ebe ha na-ekuziri onwe ha ihe kwuru na ike agwụla ha ị nọ n'ụlo ma rịọ ka gọọmentị wepụ mmachị amachịrị ụlọakwụkwọ. Ndị Nne na Nna Eze Chinyere bụ onye nkụzị n'Ezamgbo kwuru na etu esi mechie ụlo akwụkwọ amasịghị ya were sị na ya chọrọ ka gọọmentị mepee ụlọ akwụkwọ ka ụmụaka gụọ akwụkwọ. Theresa Oge, onye nwa ya nọ n'ụlọ kamgbe kwukwara na obi adịghị ya mma na-ekwukwa na mgbachị a ga-eme ka nwa ya chefụọ nke ọ mụtara. Otu onye ọzọ kwa bụ Ogbu Monday kwuru kwara ka gọọmentị biko bido agụmakwụkwọ n'ụlo akwụkwo ọzo n'ihi na ụmụ ha na-echefu ihe ha mụrụ. Ndị isi ụlọakwụkwọ Faith Okere bụ onye na-achịkọta ụlọakwụkwọ Great Lawrawoods Queens Hall kwuru na uche ya maka iwu gọọmentị maka mmachi ule Waec gbara mkpị. O kwuru na ọ dị mkpa ka echekwa ụmụaka nke mere ka ya bụ iwu maka ule Waec masị ya mana o kwuru na ya bụ iwu adịghị mma maka na ụmụaka agaghị enweike ịnweta asabodo ha ga-eji banye mahadum. Gọọmentị Naijiria eji coronavirus ebupu ego? Okere kwuru na dịka ọ dị ugbu a, na ụmụakwụkwọ ga-agba mbọ ị na-agụ akwụkwọ ha ka ha dị njikere mgbe ọbụla ewepụeụ mmachị ya bụ ule. Ihe Gọọmentị kwuru maka nke a Mịnịsta nke steeti na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba kwuru na ọbụghị na gọọmentị achọghị ka ụmụaka ga lee ule kama ọ bụ nchekwa ụmụaka ka ha bu n'obi.Nwajiuba kwuru na ego nne na nna kwuru Waec agaghị ala n'efu." afirika-45542918,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45542918,Cristiano Ronaldo akpawala ike na Juventus,Nwa Pọtụgaal bụ Ronaldo agaala na mba Itali malite igosi ike ya ebe o nyere goolu mbụ ya na Serie A taa n'asọmpi Juventus na Sassuolo gbara.,"Juventus ji nde paụnd 99.2 zụta Ronaldo O nyere goolu mbụ ahụ na nkeji iri ise wee tụkwasịkwa ọzọ ka nkeji iri na ise gachara. Sassuolo mechara nye otu goolu n'oge a gbakwụnyere mana Juventus meriri ọkpụ abụọ a satara otu. Mmeri a bụ nke anọ Juventus na-enweta n'asọmpi anọ ha gbarala ka afọ a malitere. Ronaldo anọọla n'ama egwuregwu nkeji 320 tupu o nye goolu mbụ ya kamgbe e jiri ego nde paụnd 99.2 wee webata ya n'otu Juventus ahụ. Tupu a gbaa asọmpi ahụ, onye nkuzi Juventus bụ Massimilliano Allegri, kwuru na ọ naghị eche ya na Ronaldo enyebeghi goolu agbanyeghi na ọ nwaala ihe ruru ugboro 23 n'ime asọmpi atọ ha gbarala. N'okwu ya; ""Anaghị m ele anya ka Ronaldo mee karịa ihe o mere n'asọmpi atọ gara aga. ""Ana m eche na echi nwereike ịbụ ụbọchị ya."" Ronaldo nyere goolu 44 n'otu Real Madrid n'agba asọmpi gara aga, gụnyere 15 o nyeburu n'asọmpi Champions League n'ụzọ inweta nturugo nke atọ n'otu ahịrị. Juventus na-achọzị ụzọ ibu iko Champions League nke ha na-enwetabeghi n'ihe ruru 20. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-57232176,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57232176,Israel-Palestinian conflict: Ọ bụ amara Chukwu mere na ogbunigwe egbughi m n'ụlọ m - Ogbonna Ibezito,Ibezito Ogbonna dị afọ iri atọ na asatọ ma bụrụ kwa bụ onye gbara agba U-23 nke ndị otu bọọlụ Naijirịa agbanahụna ọnwụ dịka ọgbunigwe si Gaza danyere n'ụlọ ya dị na Ashod na mba Izrel n'izuụka gara aga.,"Ogbonna Ibezito gbaburu Naijirịa bọọlụ agbanahụna ọnwụ dịka ogbunigwe dara n'ụlo ya. Ogbonna onye soro ndị otu Hapoel Tel Aviv were buru iko mba Israel n'afọ 2006 na 2007 na nwinye ya na ụmu ya no n'ụlọ ha mgbe ya bụ ogbunigwe dara n'ụbọchị. Enweghị mere ezinụlo ya kama Ogbonna merụru ahụ ma a kpọrọ ya gaa ụlo ọgwụ. Ogbonna gwara BBC Sports sị "" Nke a na-eme ya ugboro atọ ihuọma m na-azọpụta m dịka ogbunigwe a egbughị m, enwela m ihe mberede okporo ụzọ ma nwee kwa mgbe ndị ohi wakporo na Naijirịa"". ""Anyị ma na enwereike ịtụ ogbunigwe kama opi na-egbukarị iji gwa ndị mmadụ na ogbunigwe nwereike ịda. Ndị mmadụ na-agbaba n'ụlọ nchekwa mgbe ọbụla anyị nụrụ opi a"". "" A na m eri nrị ụtụtụ mgbe opi a daara kama echere m na ọ ga-adị ka ụbọchi ndị ọzọ anyị ga-agbaba n'ụlo nchekwa, amaghị na ọ ogbunigwe ahụ ga-ada n'ụlọ m"". ""A nụrụ m ihe dara ụda ma tulie m elu site n'ebe m na-eri nrị tụga m n'ọnụ ụlo m na-ehi ụra"". Ụlọ Ibezito Ogbonna dịka Ogbunigwe dachara na ya ""Nwunye m na ụmụ m nwekwara ihuọma, ha emerụghị ahụ"" Ogbonna kwuru sị, "" Emerụrụ m ahụ ma ikpere m na-afụ kwa m ụfụ nke ukwu. A nọ m n'ụlọọgwụ awa ole na ole ebe ha mere nyocha dị iche iche iji mata etu ime ahụ m dị"". Ihe Iribeama Dịka onye gbarala bọolụ na mba Romania, Saụt Afrịka, Albania. Kazakhstanm na North Macedonia, ụdịrị ihe mberede a emetubeghị ya mbụ. Ọ gara n'ihu kwuo, ""Na m sị na ihe a mere m pụta bụ ihe iribeama dị ukwu n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-emerụ ahụ ebe ọ dị njọ"" ""Echefughị m, ndị madụ na-agbatara m ọsọ enyemaka"" Ihe onyonyo gosiri ka ndị ọrụ ahụike gbata gbata na-enyere Ogbonna aka Ugbu a ha na-enweghịzị ụlọ, Ogbonna na ezinụlo iri na atọ ọzọ nọ n'ụlo ndịna dịka gọọmentị Mba Israel na-achọrọ ha ebe obibi ọzọ. N'otu aka ahụ Ogbonna onye gbaburu ndị Kaizr Chief nke ndị Saut Afrịka ka bụ kwa ọdịnobi ndị nkwado otu Hapoel Tel Aviv nke mba Israel. O kwuru sị, "" Ndị nkwado Hapoel Tel Aviv gosiri na ha hụrụ ma n'anya, ha zitere m ozi ebe ụfọdụ ebidola ịtụkọtara m ego maka ihe ọdachi a"". 'Izrel ka bụ obodo chekwara nke ọma' Dịka mba Israel na Gaza kwụsịrị ọgụ ha lụrụ ụbọchị iri na otu, Ogbonna ka kwenyere na israel bụ obodo nwere ezi nchekwa ma sị kwa na ohere dịịrị ndị Naijirịa na-gba bọọlụ ịbịa na mba Israel bịa chọrọ akara aka ha." 45473848,https://www.bbc.com/igbo/45473848,Britain: Nwafọ Naijiria eburula ọrịa 'monkeypox' gaa Lọndọn,Ndị ọrụ ahụike Ingland ekwuola na otu onye Naijiria nọ n'ọnọdụ ndịagha mmiri dị na Cornwall bu ọrịa mọnkịpọks banye Briten ụbọchị Faide.,"Onye ọrịa ahụ na-anara ọgwụgwọ n'ụlọgwụ a kpọrọ Royal Free Hospital dị na Lọndọn E bugara onyeọrịa ahụ na ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Royall Free Hospital dị na Lọndọn ụbọchị ụka. Ndị ọkachamara n'ahụike na mba ahụ na-agba mbọ ịchọ ndị ha na nwa amadị ahụ nwere mmetụta, ndị gụnyere ndị ya na ya bakọrọ n'ụgbọelu iji nweta ozi n'aka ha ma nye ha ndụmọdụ. Nwa amadị ahụ si Naijiria gawa Lọndọn n'abalị abụọ nke ọnwa Sepụtemba, afọ 2018. Onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dkta Michael Jacobs kwuru na mọnkịpọks anaghị efe efe ọsịsọ n'etiti ndị mmadụ ebe ikike ya ịba n'ime obodo dị obere. Mọnkịpọks bụ ọrịa na-efe efe nke a na-enweta site n'anụ ọhịa bu nje ọrịa ahụ. A na-enwetakwa ya site n'imetụ onye ọ na-arịa ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50361803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50361803,Ncheta Ọbịbịa Eri: Mmemme a ebirila ọkụ n'Aguleri ugbua,Taa ka ndị obodo Aguleri na eme emume ncheta ọbịbịa Eri.,"Eze Chukwuemeka Eri Nke a bụ nnukwu emume, ọbụghị sọ n'Aguleri kama n'ala Igbo niile gbaa gburubguru. Dịka akụkọ sị kọọ, Eri bụ nna ndị Igbo niile. N'ihi nke a ka ndị Igbo niile ji akwanyere emume ncheta ọbịbịa Eri nnukwu ugwu. BBC Igbo kwụ chịm na ya bụ emume wee na-ewetara gị etu ihe niile sị aga. Lee ya na foto ndịa: Ihe ọkpụkpụ na-egosi Eri onye ụfọdụ sị na ọbụ ya bụ nna ndị Igbo niile Ndị eze si ebe dị icheiche n'ala Igbo gbara ụkwụ n'Aguleri taa Igwe Nnaeme Achebe, Obi nke Ọnịcha nọkwa ebe ahụ, ya na onye enyemaka ya Onye na-anọchite anya Ooni nke Ife dị n'ala Yoroba Ndi ichie ndị Aguleri nọkwa ya n'ozuzu oke Anaghị achọ ụmụnwanyị achọ Ọtụtụ ụmụnwanyị isi ojii mba Amerịka bịakwara ya bụ emume Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria" afirika-51283586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51283586,Menstrual Cycle: Ihe mere e ji akpaso ụmụnwaanyị nọ na nsọ agwa pụrụ iche n'ala Igbo,Omenala Igbo na-akwanyere ụmụnwanyị ugwu pụrụ iche.,"N'oge ugbua, nsọ ụmụnwaanyị anaghị egbochi ha ime ihe ọbụla, mana ọ dịghị otu a n'oge gboo Ọ dị ọtụtụ ihe kpatara nke a mana otu n'ime ha bụ maka ọmụmụ nwa na. Ha kwenyere dịka ndị dibịa Bekee kwetere na ihe e ji asị na nwaanyị etozuola ihe e ji nwaanyị eme bụ mgbe o bidoro na-ahụ nsọ ya. Dịka ọdịdị ahụ ha sị dị, ọbara na-apụ n'ahụ ụmụnwaanyị kwa ọnwa ọbụla. Oge dị otu a ka a na-ekwu na nwaanyị nọ na nsọ ya. Ihe osise iji gosipụta nwaanyị nọ na nsọ Naanị nwaanyị di ime, nke mụrụ nwa ọhụrụ, nke erubeghị ihe e ji nwaanyị eme, maọbụ ndị afọ ha gbagotere bụ ndị anaghị ahụ nsọ ha. N'oge ugbua, nwaanyị nwere ike ịnọ na nsọ ya ma na-akpagharị maọbụ eme ihe sọrọ ya. Mana ọ dịghị otu a n'oge gboo. N'oge gboo, nwaanyị nọ na nsọ anaghị e siri di ya chiri echichi nri Ihe nwaanyị anaghị eme maọ nọrọ na nsọ N'oge ahụ, nwaanyị nọrọ na nsọ, ọ bụghị ihe niile ka ọ na-eme, ọ bụghịkwa mmadụ niile ka ya na ya na-emekọrịta. Iji maa atụ nwaanyị nọ na nsọ agaghị esiri di ya nrị ma ọ bụrụ na di ya chiri echichi. Ọ bụrụkwa na di ya bụ dibịa, nwaanyị ahụ agaghị ahụ di ya anya ganye na oge nsọ ya agwụ. Ụfọdụ ndị, dịka ndị dinta maọbụ ndị ọka mgba anaghị ekwe abịa nwaanyị nọ na nsọ nso n'ihi na a na-eche na ọ nwere ike iwetara ha chi ọjọọ. N'oge ahụ, ọ bụ ihe arụ idina nwaanyị nọ na nsọ. Gịnị kpatara nke a? Dkt Mcginger Ibeneme Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, onye nkuzi asụsụ Igbo na Mahadum Legọs kọwara ihe kpatara nke a. O kwuru na ""Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ. ""Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya."" Joachim Obiejesi, onye okenye si Obodoukwu n'Imo steeti kwuru na ""nsọ nwaanyị na-emebi ihe nwoke ji chekwara onwe ya."" Ọ kọwara na tupu ụka Kraịst abata n'ala Igbo, nwoke ọbụla nwere ọgwụ ọ na-eji echekwara onwe ya mgbe niile. ""Ndị oge ahụ na-eche na nsọ nwaanyị na-arụ ọgwụ, ya mere ha anaghị achọ ka nwanyị dị etu ahụ ruo ha nso."" Ụbọchị pụrụiche maka nsọ nwaanyị Mana Dọkita Bekee bụ Mcginger Ibeneme kọwara na ọ bụghị maka ọgwụ, ọ bụghịkwanụ maka mmegbu ụmụnwaanyị. Ibeneme kọwara na ọ bụ ugwu ka a na-akwanyere nwaanyị nọ na nsọ, ọbụghị mmegbu. O kwuru sị: ""Nsọ nwaanyị bụ ihe nrụtụ aka maka ọmụmụ nwa, nke a kpatara e ji akwanyere nsọ nwaanyị ugwu pụrụ iche."" ""Ihe ọzọ kpatara e jighi ekwe ka ha sie nri maọbụ chuo mmiri bụ maka na ọbara na-apụ ha n'ahụ, nwere ike mebi mmiri ma ọ banye ya ịchụta mmiri."" ""Ọ bụ maka ahụ ike ha na nke ndị ọzọ ka e ji asị ha nọrọ otu ebe ruo mgbe nsọ ha kwụsịrị."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn" afirika-51874221,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51874221,"Biafra Agitation: 'Ahụrụ m ọgụ sharịa, achọghị m ịhụ ọgụ ọzọ' - Funnybone","Stanley Chibunna, onye ọkpaọchị e ji 'FunnyBone' mara kwuru na ya akwadoghi iji ụzọ ọgbaghara achọ nnwereonwe Biafra.","Funnybone Funnybone kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, a kpọrọ gịnị na-afịọ. Ray Emordi, onye Igbo na-eme ihe ejije Nollywood, sonyekwara na mkparịtaụka ahụ. N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya kwadoro ihe ọbụla a ga-eme ka ala Igbo kawanye mma. Mana aka ya agaghị adị na nke ọbụla bụ tigbuo zọgbuo. Funnybone na Ray Emordi O kwuru sị: ""E toro m n'ugwu awụsa, na Jos nakwa Kaduna."" ""A hụrụ m ọgbaaghara sharịa n'afọ 2000 dịka nwata akwụkwọ."" ""A hụkwara m ọgụ a lụrụ na Jos n'afọ 2003."" ""Ihe ndị m ji anya m hụ n'oge ahụ ka dị m n'isi ruo taa."" ""Anyị gbasara akwụkwọ oge ọgụ bidoro, a na m ama ozu ndị mmadụ elu oge m na-agba ọsọ ndụ."" ""Ihe ndị a abụghị ihe m ga-ahụcha, mmadụ asị m ka m bịa kwadoo ọgbaaghara ọzọ. Mba!"" ""Ọ bụrụ na e nwee ọgbakọ maọbụ ntuliaka iji kwuo ma a ga-ekewa, nke ahụ ka m ga-akwado."" Ihe ụmụ Igbo ama ama kwuru maka ịnweta Biafra N'otu aka ahụ kwa, Ray Emordi rịọkwara ka onye ọbụla rube isi n'iwu obodo ka ọ dịrị onye ukwu na onye nta mma. Ọchịchị Naịjirịa Funnybone na Ray Emordi Funnybone na Ray Emordi kwuru na ọ ga-amasị ha ka onye Igbo chịa Naịjirịa otu ụbọchị. ""Ihe ndị Igbo gabigara oge a lụrụ agha Biafra ma mechaa wulikwaa ọzọ gosiri na Igbo siri ike,"" Funnybone na-ekwu. ""Ya mere m ji chọọ ka onye Igbo chịa Naịjiria oge anyị niile ka nọkọ ọnụ dịka otu mba."" ""Ọ bụrụ na e mechaa kewaa, nsogbu adịghị, mana ugbua, ọ ga-adị mma ma onye Igbo chịa."" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Onweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsị ọrụ ike'" afirika-57098385,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57098385,Bende Police station: Mgbọ egbe merụrụ ndị uweojii ahụ na mwakpo ndị oji egbe mere na Bende,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa Steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC ndi uweojii abụo merụrụ ahụ dịka ndị ji egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụlọ ọrụ ha dị n'obodo Bende ọkụ n'abalị.,"Maazị Ogbonna sị na ndi bịara mwakpo ruru mmadu narị, nke ọ sị mere ndị uweojii ejighi nwee ike ịchụla ha. Dịka o siri kọwa, ndị gbara ụlọ ọrụ ndị uweojii ọkụ ma gbakwaa ụgbọala onyeisi ndị uweojii na ọzọ ndị uweojii ji ọkụ. Ihe ọzọ ha gbara ọkụ bu ọgbatụmtụm, ụlọ igwe ọkụ nakwa ụlọ nzukọ dị n'isi ulọ ọrụ okpuru ọchịchị Bende. Gọvanọ Steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu ka si ebe ahụ pụọ tupu mwakpo a emee. Nnenna Ukeje na Gọvanọ Ikpeazu n'ọgbakọrọ e mere na Bende tupu mwakpo a emee Ikpeazu bịara ọgbakọ e mere maka ịnabata Nnenna Ukeje bụbu onye nnọchị anya mpaghara Bende na ụlọ omeiwu nta n'Abuja. Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahu kọwara na ebe niile tọgbọọ chakoo dịka ndị agha anaghị achị ọchị ma chaa wujuru ụzọ niile. Ụjọ ji ndị Bende Ụlọọrụ ndị uweojii na Bende a gbara ọkụ Onye ntaakụkọ BBC gara na Bende ebe ya bụ ihe mere ka o were anya ya hụrụ etu o si mee. Oge ọ garuru, ọ chọpụtara na ebe niile dịka ebe a gbara ọsọ, n'ihi na ndị mmadụ ka na-atụ egwu na ndị ọrụ nchekwa nwere ike ịba kpụkọrọ ha niile n'ihi mwakpo ahụ. Na mbụ, onye ntaakụkọ anyị enweghị ike ịbanye n'ogige ndị uweojii ahụ a gbara ọkụ n'ihi na ndị agha Naịjirịa ewerela ọnọdụ ebe ahụ. Mana ha mechara hapụ ya ka ọ banye ma see foto etu ebe ahụ dịzi ugbua. Ben Nwabueze, onye obodo Bende, gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri mmadụ atọ n'ụtụtụ taa ma kpụrụ ha pụọ. ""Ọ bụ ya mere ụjọ ji jide ndị mmadụ maka na anaghị agwa ochi ntị na agha esula,"" Nwabueze kwuru. Onye ọzọ bụ Chioma Oleka gwakwara onye ntaakụkọ BBC na ụfọdụ ndị be ha na-apụ n'isi ụtụ ịga chọọ ihe afọ ga-eri, mana onweghị onye ụjọ kwere pụọ n'ụtụtụ taa maka adịghị ama ama. Onye ntaakụkọ anyị chọpụtakwara na ndị ọrụ nchekwa emechia okporoụzọ ebe ụlọọrụ ndị uweojii ahụ dị, ha anaghị ekwe ka ụgbọala ọbụla si ya bụ ụzọ. Ndị mmadụ na-agbazị ụzọ Ohafia maọbụ Arochukwu, ebe ndị ọzọ na-ezi ụzọ Uzuakoli, Isikwuato nakwa Igbere. Na Bende n'ụtụtụ Tọzde, okporoụzọ tọgbọ chakoo, ụlọahịa mechichara emechi, ebe ụfọdụ ndị mmadụ gbakọrọ na-akọ akụkọ ihe merenụ. BBC chọpụtara na ụgbọala anaghị esizi n'okporoụzọ ebe ya bụ ihe mere n'ihi na ndị ọrụ nchekwa mechiri ya Ụgbọala a gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii na Bende Ụgbọala nakwa ọgbatumtum e mebiri n'ime ogige ndị uweojii ahụ" media-43695633,https://www.bbc.com/igbo/media-43695633,Chelsea na-agba mbọ ka ha so n'ime Champions League,"Chelsea na West Ham sọrọ mpị n'iko FA ụnyaahụ, ha nyere onwe ha goolu otu, otu.","Cesar Azpilicueta nyere goolu nke ise ya n'asọmpị iko Premier League n'asọmpị Chelsea na West Ham Onye otu Chelsea bụ Cesar Azpilicueta kwuru na ihe a nwere ike imebi olileanya Chelsea nwere maka iso n'ime otu nke anọ kachasị n'iko Premier League n'afọ a. N'ihi ka asọmpị ha na West Ham siri ga, otu dịka Liverpool ji akara iri karịa Cheslea, otu Tottenham bụ nke atọ na anọ kachasị ugbua. Ihe a pụtara na ọ dịka Chelsea agaghị eso n'asọmpị iko Champions League nke bụ ugboro abụọ ụdị ihea na-eme. Cheta na ha chụrụ Jose Mourinho n'ọrụ ya dịka onye nkuzi ndị Chelsea n'afọ 2015-16 maka na Chelsea pụtara dịka otu nke iri. O nwere ndị na-ekwu na Twitter na Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'iko Europa League. Ugbua ndị mmadụ na-ajụ ihe ga-eme Antonio Conte ma ọ bụrụ na Chelsea agaghị eso n'asọmpị Champions League n'afo a. Chelsea ka nwere olileanya na ha ga-eso n'asọmpị Champions League, mana ọ bụrụ na otu ndị ọzọ merịrị Liverpool n'ime asọmpị ise ha nwere n'ihu, ma ọbụ Tottenham nwere asọmpị isi n'ihu. Chelsea na Southampton ga-asọmpị n'ụbọchị uka n'ọgbọ egwuregwu Wembley. Ha ka na-enwe olileanya na ha ga-emerị n'asọmpị nke a. Cesar Azpilicueta Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46930651,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46930651,Nigeria Elections 2019: Ike agwụla ndịisi ndịagha Naịjirịa - Atiku,Njem ntuliaka 2019 na-agazị ọsisọ ọsịsọ.,"Oto onye n'ime ndị chorọ ka atunyere ha, bu Atiku Abubakar bịara ka ya na BBC nwee mkparịtaụka. Atikụ kwuru maka afo ya, dịka onye abụghịzị nwata, ma tinyekwe ọnu n'ihe banyere ndị ọnọdụ nchekwa Naịjirịa. Gee ya n'uju. Akuko ga-amasị gị:" afirika-43722097,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43722097,Gbalahụ idina onye nkuzi gị n'ụzọ ise a,Mahadum OAU na-ewu na sochal midịa maka akụkọ na otu onyenkuzi chọrọ idina nwakwụkwọ iji nye ya ngafe n'ule.,"Inye onwe, ego na ihe ndị ọzọ iji gafe n'ule bụ ihe na-emezi Ọtụtụ na-ekwu n'igwe okwu Twitter na ihe dị otu a bụ ihe na-eme n'ọtụtụ mahadum n'ala Naịjirịa ebe a na-ebo ebubo na ndị nkuzi na-amanye ụwụakwụkwọ ụmụnwanyị inye onwe ha, ego na ihe dị ọzọ iji nweta akara dị elu n'ule. Tolu Ayeni kwuru: "" Gịnị mere OAU ji ewu? Anyị na-eme mkpọtụ maka ndị ụlọakwụkwọ ebe anaghị ekwe ụmụakwụkwọ tinye uchu gụọ akwụkwọ iji nwe ezigbo akara."" End of Twitter post, 1 Mana otu onye nkuzi mahadum, Enugwu State University (ESUT) na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na ugbua, na ọ bụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị bụ ndị na-enye ndị nkụzị nsogbu ka ha dina ha iji nwe ngafe n'ule. ""Achọghị ikwu ihe ọbụla banyere okwu a n'ihi na ugbua ọ bụ ụmụakwụkwọ bụ ndị na-enyegharị ndị nkuzi nsogbu."" Lee ụzọ i nwere ike iji kwụsi mmekpaahụ inye onwe maka igafe ule: 1. Site na ị mata ihe mmekpaahụ inye onwe pụtara Ọtụtụ ụmụakwụkwọ na ndị na-akụzịrị ha amaghị ihe mmekpaahụ nwoke na nwanyị pụtara maọbụ ihe onye ga-eme a kpọ ya mmekpa ahụ. Mmekpaahụ mmekọrịta nke a kpọkọrọ sexual harassment na bekee bụ ịrịọ mmadụ mmekọrịta mana ọ bụrụ na onye ahụ jụ, o nwere ike inweta ntaramahụhụ. Maọbụ omume dịka imetụ aka, ịma njakịrị maọbụ omume akwụghị ọtọ nwere ike nye onye a na-emesa ya mgbaka ahụ. Onye kachamara n'ihe gbasara ikike diri onye siri kọwara na ọ dị kpa ka mmadụ mara ihe ọ bụ, mara oge e mere ya maọbị mgbe ị na-eme ya mmadụ. 2. Ịgusi akwụkwọ gị ike Ọ dị mkpa ka nwataakwụkwọ mahadum tinye uchu n'ịgụ akwụkwọ ya iji gafe n'ule ya ma gbalahụ ohere onye nkuzi obi ya adịghị ọcha inwale ya. Onye ọkaiwu bụ Chukwuemeka Eze kọwara sị: ""I gụsie akwụkwọ ike, ị gafe n'ule. Ị daa ule, ịchọwa ka e nyere gị aka, onye nkụzị achọkwa ka i nyere ya aka."" Chukwuemeka Eze kwuru na nwakwụkwọ agbaghị mbọ daa ule, ọ chọwa enyeremaka, nke nwere ike inye ohere ka onye nkụzị chọwa imekpa ya ahụ. 3. Itụ Egwu Chineke/Ji ezi ejiji Eze onye bụ onyenkụzi na mahadum Nasarawa Steeti kwuru na ịtụ egwu Chineke ga-eme ka nwataakwụkwọ na-ejikere ụzọ dị mma ghara ighewe ahụ ya oghe ma na-akpa ezi agwa iji gbalahụ ịdabanye n'ọnya onye nkuzi. ""Ọ bụghị onye na-eghewe akwa ya ọnụ emecha ọ sị na onye nkuzi na-enye ya nsogbụ. ọ bụ ya na-ebute ụzọ aghụghọ 4. Ị na-egosi agwa dịka onye ndu Eze kwuru na nwata akwụkwọ na-egosi agwa onye ndụ, ndị nkuzi ya ga na-enye ya ugwu ma na asopụrụ ya. "" O nwere ka ọ na adị, okenye a na-asọpụrụ nwata."" 5. Kwuputa ihe mere Ihe kpatara na mmekpahụ ụmụnwaanyi na-aga n'ihu bụ n'ọtụtụ o metụtara anaghị ekwupụta ya nke mmere ka ndị nkuzi obi adịghị ọcha ji nwee ike ịga n'ihu na ihe ha na-eme. Mana dịka ọkaiwu Eze nyere ndụmọdụ, ọ bụrụ na nwakwụkwọ na-agba mbọ nwe mmekpaahụ, onyenkuzi kwada ya, o nwere ohere iti mkpụ ka onye ọzọ tulee akwụkwọ ule ya. Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuchitere mahadum OAU nke a kpọrọ aha n'ebubo ahụ na-ewu bụ Abidodun Olanrewaju nwere, o kwuru na ndị isi mahadum ahụ na-enyocha ebubo ahụ. ""Anyị egela mkparitaụka ahụ na-efegharị. Anyị na-enyocha ya iji ma na ndị anụrụ olu ha na mkpaịrtaụka ahụ bụ ndị sị ụlọakwụkwọ anyị. ""OAU anaghị eji nti anụ ihe gbasara mmekpaahụ metụtara mmekọrịta nwoke na nwanyị."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50158353,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50158353,Innoson Motors: Etu m si lafere n'aka ndị bịara igbu m - Ọkaiwu ya,"Igbo na-atụ ilu sị na onye chi ya egbughị, onweghị onye ga-egbu ya.","Foto ochie: Ndị ntaakụkọ na-agba Innocent Chukwuma ajụjụ ọnụ. Etu a ka o si mee na ndụ Mccarthy Mbadugha bụ ọkaiwu Innocent Chukwuma onye nwe Innoson Vehicle Manufacturing. Ihe merenụ? Mbadụgha kọọrọ BBC Igbo na ndị ogbu ara ọbara wakporo ya n'ụlọọrụ ya wee kụọ ya ihe tinka kụrụ pan. O kwuru na ha hapụrụ ya gbalaga oge ha che na ọ nwụọla, mana ọ nwụghị. Nke a mere n'ọnwa Oktoba afọ gara aga (2018). Mana ọ bụ abalị abụọ gara aga (ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba 2019) ka akụkọ ahụ malitere iwu na soshal midia. Ndị mmadụ boro ebubo ma na-ekwu na ọ bụ maka ikpe dị n'etiti Innoson na otu ụlọakụ a ma aha ya kpatara e ji zite ndị bịara igbu Mbadugha. Ha kwukwara na ọ bụ na nsonso a ka ya bụ ihe mere. Mana Mbadugha gwara BBC na ya bụ ihe agbaala afọ. N'okwu ya: ""Agara m ụlọọgwụ na Naịjirịa nakwa mba ofesi tupu m nweta onwe m nke ọma."" ""Agbakechaala m ugbu a, mana okwu ahụ ka dị n'ụlọikpe."" O kwukwara na ya amaghị ndị zitere ndị bịara ije ọjọọ ahụ. Aka enwe chọrọ ịghọ aka mmadụ Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ Mbadugha kwuru na mgbe ya bụ ihe mere ọhụrụ, ndị uweojii buuru okwu ahụ n'isi ma tukpo ya asị. Ọ sị na ndị uweojii gara gwa ndị ntaakụkọ na ọ bụ ndịọrụ ya o ji ụgwọ bịara wakpoo ya ma chọọ ịkụgbu ya. Mbadugha kwuru na nke ahụ mere o ji bido rọwa anya ma o nwere ihe ndị uweojii chọrọ izo. O kwuru sị: ""A nwụchiri ụfọdụ ndị ahụ bịara wakpo m, mana onweghi mgbe ha ji kwuo na ha bụ ndị ọrụ m."" ""Onyezi gwara ndị uweojii na ọ bụ ndị ọrụ m wakporo m?"" ""Ewepụla m okwu ahụ na nke onyeisi ndị uweojii ka o tinye ya ọnụ."" ""Edekwaala m akwụkwọ degara ndị ọrụ ntaakụkọ ahụ dere ya bụ akụkọ."" ""Ha ga-edegharị ya ma kwuo nke bụ eziokwu, ma rịọkwaa m mgbaghara."" ""Emeghị otu a, m ga-akpọpụ ha ụlọikpe ka ha gaa zara ọnụ ha."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Career Choice: Ọrụ Bekee na ịrụrụ onwe gị ọrụ, kedụ nke na-amasị gị?" egwuregwu-45308905,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45308905,Ọ bụ ụjọ Efe Ajagba 'chụpụrụ' onye America n'ogige ọkpọ?,Curtis Harper bụ onye mba Amerịka ya na Efe Ajagba bụ onye Naịjirịa zukọrọ ịkụ ọkpọ kwuru na ihe mere o ji gbapụ ọsọ bụ maka ego.,"Efe Ajagba nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi Olimpiks nke afọ 2016 e mere na Rio de Janeiro Harper dị afọ 30 gwara Jordan Hardy bụ onye ntaakụkọ na ọ pụrụ ozugbo a kụrụ mgbịrịgba ka ọkpọ bido, makana ọ chọrọ ka a nụ olu ya mara ihe a ga-eme ego ole a na-akwụ ya (O kwuru na anaghị akwụlite ya ụgwọ). Ya na Ajagba dị afọ 24 kwesịrị ịkụ ọkpọ nke 'heavyweight' n'abalị Ọgọst 24 nke 2018, mana ọpụpụ o si n'ogige ahụ dị na Minneapolis n'Amerịka pụọ mere ka Ajagba nweta mmeri na-atụpụghị otu mkpụrụ ọkpọ. Ozugbo Ajagba pụtara ịkụ ọkpọ ka a kụchara mgbịrịgba, Harper ji ọsọ si ụzọ nke ọzọ gbapụ. Onye na-azụ Harper bụ Nate Campbell, kwuru na omume ya emechuola ya ihu. O dere na soshal midia sị ""Nwoke a kparịrị onwe ya, nwunye ya, ndị na-akwado ya na mụ onwe m."" Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ ""ebe ọ bụ na ọ chọghị, gịnị kpatara o ji kweta ịkụ ọkpọ ahụ ma kwere nara ego?"" Onye bụ Efe Ajagba? Ihe ndị mmadụ na-ekwu @Ryansongalia kwuru na ọ hụtubeghị ebe mmadụ meriri ọkpọ na-atụpụghị otu mkpụrụ ọkpọ. @greyjohnson kwuru na mmeri Ajagba a emeela ya mmeri kacha bịa ọsịsọ kemgbe e bidoro ịkụ ọkpọ. @kcad13 kwuru na ọ ga-agbafukwa ma ọ bụrụ ya ka onye dịka Ajagba bịara ịkụ ọkpọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51994646,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51994646,Coronavirus: Adeboye kara ụka ya n'okpokoro ụlọụka Redeemed,Ụkọchukwu Enoch Adeboye nke ụlọụka Redeemed Christian Cgurch of God (RCCG) kara ụka nke Sọnde ya n'ụlọ mmadụ elughi iri abụọ no n'ime ya dịka iwu gọọmentị Legọs siri kwuo.,"Adeboye mere nke a n'agbanyeghị na ọ bụ ụlọuka ya adịghị na Legọs. Atụmatụ a bụ dịka Naịjirịa nwetere mmadụ iri abụọ na asaa nwere nje coronavirus na Abuja, Legọs, Ekiti nakwa Oyo. Ụtụtụ ụka, ọkachasị nke ndị Katọlịk na CMS mechiri emechi na Legọs n'ụtụtụ ụka dịka gọọmentị Legọs sị ka akwụsi ọgbakọ karịrị mmadụ 20 iji gbochie ikesa coronavirus. Agbanyeghi na ụfọdụ ụka mepere na Legọs, ụka Sọnde adịghị etu ọ na-adibu ka ọtụtụ mmadụ noduru n'ụlọ ha. N'ụka ndị mepekwaranu, ndị mmadụ na-ekwu na enyere ha ihe ha ga-ete n'aka iji gbochie ya bu nje. A kara ụka n'ụka Reemed dị n'ụzọ e si aga Legọs mana ọ bụ so so mmadụ iri abụọ nọ na ya bụ ụlọ ụka na-abata ihe ruru mmadụ pụku ise. Lee foto ụfọdụ ndị mmadụ wetere anyị banyere etu ụka siri dị n'ogbe ha. Ụlọụka RCCG dị n'Ikoyi tinyere akwụkwọ na ụzọ ha iji gwa ndị mmadụ na ha agaghị aka ụka taa Ụlọ ụka Saint Vincent dị n'Olodi Apapa emepeghidi ma ncha Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki mepere mana ha mere nkwụcha nke Bekee kpọrọ ""social Distancing"" Ejikwa ihe nyụcha aka anabata ndị bịara ụka n'Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki Ụlọ ụka Saint Mary dị n'Isolo ekweghịdị ka mmadụ banyere ma ya fọzịa ika ụka Ụka Messiah dị n'Okota na Legọs tọgbọrọ chakoo" afirika-49028356,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49028356,FaceApp Challenge: Obi ọkara gị itinye foto gi ka FaceApp gbanwee ya?,"Mmadụ niile na-ekwu maka 'FaceApp' bụ akụrụngwa na-agbanwe foto mmadụ, mee onye bụ nwata ka ọ dị ka okenye.","Puku kwuru puku mmadụ na-eke mpụtara ihe ha ji akụrụngwa FaceApp mee na soshal midia. Mana ụfọdụ mmadụ ekwuola na obi adachaghị ha duu maka ya. Ha sị na ụlọọrụ mepụtara ya bụ akụrụngwa anaghị akpachapụ anya etu ha si ejikwa ozi gbasara ndị mmadụ ha ji foto ha rụọ ọrụ. Mana FaceApp sịkwa na ha na ehichapụ ọtụtụ n'ime foto na-abata ha aka. Ha sị na ọbụ naanị foto ndị mmadụ hopụtara ka ha na-ewerụ emepụte foto ahụ na-ewu. Ọ gịnị bụ FaceApp? FaceApp abụghị ihe ọhụrụ. Ọ bụ ihe eji kọọ akụkọ n'afọ abụọ gara aga maka ihe Bekee kpọrọ ""ethnicity filters"". ""Filter"" ahụ na-agbanwe agbụrụ mmadụ - nke mere ọtụtụ mmadụ ji katọọ ya nke mere ejiri wepu ya. Akụrụngwa a nwereike ime ka ihu na-ewe iwe chịwa ọchị. Ọ na-agbanwekwa usoro eji achọ ihu mma. Akụrụmgwa na-arụkwa ọrụ n'ihe nka Ọ bụ ihe akpọrọ ""artificial intelligence"" (AI) ka akụrụngwa a ji arụ ọrụ. Ihe ndị tecknuzu kpọrọ ""algorithm"" na-ewere foto ihu mmadụ wee gbanwee ya. Ọ bụ nke a ga-enye ohere itinye ọchị na foto ka ọ dị ka ọ bụ etu ahu ka eji mee ya. Ọ gịnị bụzị nsogbu? Ndị mmadụ weliri nku anya ha mgbe otu onye na-eme akụrụngwa internet aha ya bụ Joshua Nozzi dere na Twitter na FaceApp na-etinye ọtụtụ foto ndị mmadụ na internet na-ajụghị ha. Mana, otu onye Frans na-eme nchọpụta maka nchekwa na intaneti eji Elliot Alderson mara mere nyocha ihe Maazị Nozzi kwuru. Ọ chọpụtara na onweghị ihe di otu a na-eme. Naanị foto ndị mmadụ tinyere ka FaceApp na-etinye na intaneti. Ndị ụlọọrụ FaceApp na onwe ha gwara BBC na ọ bụ sọsọ foto ndi mmadụ tinyere ka ha ji arụ ọrụ. Kedụ maka ihe Bekee kpọrọ 'facial recognition'? FaceApp nwere usoro eji agbanwe foto Ụfọdụ na-ekwukwa na ụlọọrụ FaceApp nwere ike iji akụrụngwa ahụ mepụta akụrụngwa ọzọ e ji ahụwa mmadụ ama. Mana Yaroslav Goncharov bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ gwara BBC na nke ahụ abụghị eziokwu. O kwuru si, ""Mba, anyị ejighị foto ndị mmadụ arụpụta ihe banyere ịmatanwu ihu mmadu(facial recognition) Ọ bụ sọsọ iji ya gbanwe foto ka anyi ji ya eme."" Gini ọzọ ka FaceApp nwere ikwu? N'akwụkwọ ozi nke ụlọọrụ FaceApp wepụtara, ha kọwara na ọ bụ naani foto mmadụ ji aka ya họrọ ka ha na-agbanwe. ""Anyị anaghị ewere onyonyo mmadụ na-enyeghị anyị ikike iwere. ""Anyị nwere ike ichekwa foto ndị mmadụ n'ikuku (cloud) mana anyi na-ehichaopụ ọtụtụ foto ndị mmadu ma o mee abali abụọ ha ji ya mechaa ihe. Gọọmenti Briten kwuru na uche ya dị n'ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere akụrụngwa FaceApp. Ha dụrụ ndị ọha obodo ọdụ ka onye ọbụla kpachapụ anya n'ihe gbasara akụrụngwa ịntanet. Ha kwuru na tupu mmadụ etinye ihe ọbụla dị ya mkpa na ịntanet, onye ahụ ga-akpachapụ anya maka na ihe ọbụla bara ịntanet dịka ihe ọkụkọ chị ụmụ nụrụ." afirika-53231593,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53231593,Female DJ: Ime 'DJ' akpọgala m ebe m na-arọghị nrọ ịgaru - DJ Wysei,"Ịgwọkọ egwu nke Bekee kpọrọ Disc Jockey maọbụ DJ n'aha ịchafụ, abụghị ọrụ dị mfe.","Na Naịjirịa, ọ bụ ọrụ ụmụnwoke na-arụkarị. Mana nwaada Igbo, Ebere Iwuagwu, onye e ji DJ Wysei mara, egosila na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwere ike ime ya karịa. Iwuagwu, onye rụrụ n'ụlọọrụ redio, 'Wazobia FM dị na Legọs, malitere ịgwọkọ egwu oge ọ dị afọ iri na asaa. Ugbua onye ọbụla ekwetala na ya bụ nwaada ma ihe ọ na-eme. Gere akụkọ ya n'ihe onyonyo dị n'elu. Ndị mere ya bụ Uche Akolisa na Nnamdị Agbanelo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44982646,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44982646,Google enyela Naijiria ohere inweta intanet n'efu,Naịjirịa bụ otu mba n'ime ise so na ndị ga na-erite elele inweta intanet n'efu site n'atụmatụ ụlọọrụ Google a kpọrọ 'Google Station initiative.',"Google chọrọ ime ka inweta intanet dị mfe n'Afrịka n'ihi oke idaọnụ data N'ime atụmatụ a, a ga-ekesa ebe nweta ịnatanet narị abụọ n'obodo mepere emepe ise n'otu afọ. Ụlọọrụ Google ebidola atụmatụ inye ụmụ Naịjirịa intanet n'efu. Google na ụlọọrụ na-arụ ụdọ igwe okwu fiber optic telecom service provider a kpọrọ 21st Century na-ejikọta ọnụ ikwado ọnọdụ maka inweta inanet n'ụlọakwụkwọ kọlej, ọdọ ahịa na ọdọ ụgbọala. Dịka ụlọ akụkọ CNN siri kwuo, Google agaghị akwụ ndị ụlọọrụ a maọbụ ndị nwe ebe a na-enweta ịntanet n'efu ụgwọ kama ha ga na-ekiri ka ego ha nwetara site na mgbasaozi azụmahịa. Onye ndu atụmatụ ahụ bụ Caesar Sengupta, kwuru sị na mmadụ ijeri ana-atụ anya isonye na iji ịntanet eme ihe agbanwewela ịntanet n'ụzọ atọ doro anya nke gụnyere iji naanị ekwentị enweta ihe na intanet nakwa inwe mmasi n'ihe gbasara ihe na-eme n'akụkụ ụwa onye nọ. Tupu google bute atụmatụ nke o bu n'obi ịgbasa n'Afrịka, ha mepere atụmatụ a na mba India, Indonesịa, Mexico nakwa Thaịland. Cheta na Facebook mepere nke ha n'ọnwa Novemba afọ 2017. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44611122,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44611122,"Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m'",Ndị mmadụ apụtala ị mee akaebe maka mkpa mkpa para na Platu steeti ụbọchị ole na ole gara aga.,"'Ebekasịrị ụmụaka erughi afọ ise isi na olu' Chukwuemeka Eze bụ dibia bekee nọ n'ụlọọgwụ mgbe ebubatara ndị mmerụrụ ahụ kọwara BBC ihe ọ hụrụ. Ọ sị na ebe niile n'esi ka ebe a na-abọ anụ n'ehihie ahụ n'ụlọgwụ mahadum nke Jọs ma tinye kwuo n'ọnụgụgụ ndị merụrụ ahụ kariri mmadụ iri ise. Onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ezekiel Danbwarang akọwarala BBC etu ndị ọchịehi siri gbuo ezinaụlọ ya. ""Ha tịkara ọnụ ụzọ m wee bata, m nụzie ụda egbe na mkpu nwụnyere m tiri m jiri mara na ha egbuola ezinaụlọ m"" N'ọnụ ya ""Mgbe ha buuru ihe niile dị n'ime ụlọ m ka ha malitere gbaa ya bụ ụlọ ọkụ"". Eserese gosiri mpaghara etiti Naịjirịa nsogbu a metụtara Ndị uweojii agaala Jos Ụnyaahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris zigara ụfọdụ ndịuweojii na ụgbọelu helikọpta abụọ na Barkin Ladi na Riyom. O zigakwuru ụgbọagha ise na ndị uweojii pụrụiche akpọrọ ""police mobile force unit"" tinyere ndị o zipụburu. Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Muhammadu Buhari edepụtala akwụkwọ ebe o kwuru na ụfọdụ mmadụ emeela ihe a ihe ndọrọndọrọ ọchịchị Ọ rịọrọ ndị nsogbu a metụtara ha nwee ndidi ka iwu ala mezuo ọrụ ejiri hiwe ya. Amabeghị ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe a ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ gafere narị abụọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43123868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43123868,Naịjirịa egbochiela ndị agha gara ịnwụchi Abubakar Shekau,BBC enwetela ozi na Naịjirịa gbochiri njem agha iji nwuchie onyeisi ndị otu na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram bụ Abubakar Shekau.,"Ndị agha Naịjirịa ekwuola ọtụtụ oge na ha gburu Shekau Ihe nkiri ndi BBC wetara gosiri ka ndị agha Naịjirịa na-aga nso n'ebe Shekau nọ n'ime ọhịa Sambisa dị na ọwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa. Mana, ka ha nọ na njem a, ha nwetere iwu ka ha kwusi. Boko Haram mechara wakpo ndị agha a, nke ha jiri ụgbọala entinyere ogbunigwe mee. Ndị agha asaa si Kameruun na Naịjirịa nwụrụ na mwakpo a. Tupu ndị agha gbakọrọ ọzọ, Shekau were ohere ahụ gba ọsọ. Otu onye so ndị a na-akpọ 'Civilian JTF' na asụsụ Bekee, so ndị agha Naịjirịa na njem ahụ kọwara ndị BBC. Ndị agha Kamerun so ndị agha Naịjirịa ebuso Boko Haram agha ""Shekau gbara ọsọ hapụ iko ya, Kọmputa ya, uwe ya na atụ ya na egbe ya n'elu okpokoro ya. Ejim anya m hụ nke a."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43972820,https://www.bbc.com/igbo/43972820,Mmachi Codeine: Dextromethorphan aga-ebe okwu?,"Na nsote nchọpụta BBC Africa gbasara etu ndị nọ na mpaghara ugwu awụsa Naịjirịa si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine, gọọmenti etiti amachiela mmepụa na mbubata ọgwụ ụkwara ọbụla nwere codeine na Naịjirịa.","Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ a dịka ihe onyinye Mịnịsịta okwu ahụike dị n'aka bụ Isaac Adewole nyere iwu a maa kwuo ka e jiri ọgwụ ụkwara nke nwere dextromethorphan nke a na-akpọ ""dextro"" na nkenke nọchie nke nwere codeine. Ugbua gọọmentị machiri mbubata ọgwụ ụkwara nwere codeine, ọ bụ dextromethorphan ka mma? Ndị ọkammụta n'okwu ihe gbasara ahụike katọrọ ihe gọọmenti ma kwuo na dextromethorphan abụghị ọsịsa nsogbu oke ịnụ ọgwụ ụkwara nwere codeine. BBC Igbo na dọkịnta Maruf Mustafa kwuru okwu. Ọ gwara BBC Igbo na codeine na dextro nọ n'otu ezịnaụlọ naanị na codeine ka atụ atụ karịa dextro. O kwuru na codeine na dextro bụ obere ọgwụike a na-akpọ ""Heroine"" na bekee. Mustafa kọwara na imachi mbubata codeine abụghị ihe ga-akwụsị nsogbu mmebi ya n'ihi na dextro na-eme otu ihe codeine na-eme mana dextro anaghị atụ atụ nke ukwuu. Nyiri dị n'etiti codeine na dextro N'aka nke ọzọ dọkịnta Hafeez Olayire kwuru na ihe gọọmenti kwesiri ileba anya bụ etu ndị mmadụ si egote ọgwụ ma ha eweghi akwụkwọ ịnata ọgwụ. Olayire kwuru na ndị a na-akpọ ndị famasi ekwesighi iresi ndị mmadụ na-ejighi akwụkwọ site na dọkịnta ha ọgwụ. Ọ kwuru na ihe ga-egbo mkpa a bụ ka gọọmentị tie iwu machie ndị na-ere ọgwụ iresi ndị na-ejighi akwụkwọ site n'aka dọkịnta ọgwụ. N'okwu ya; ""Ọ bụ ihe jọrọ njọ na ndị mmadụ na-anọkata banye n'ebe a na-ere ọgwụ ga zụrụ ọgwụ na-enweghi onye na-akwụsị ya."" ""Ihe a ka gọọmenti kwesiri ileba anya maka na a machigodi codeine, ndị mmaọ̄ụ ga ebido igbo dextro maka na ya na codeine nọ n'otu ezinaụlọ."" Gịnị ka ọgwụ ụkwara na-arụ? A na-egote ọgwụ ụkwara na-ebe niile a na-ere ọgwụ Dọkinta Maruf Mustafa kọwara na ụkwara abụghị ọrịa n'onwe ya mana ọ bụ ngosipụa ọrịa ọzọ dị mmadụ n'hụ. Mana, ọgwụ ụkwara na-aga n'akụkụ ụbụrụ mmadụ na-agwa ya kwa ụkwara mee ya ọdajụọ nke ga-eme ka ọnye ụkwara ahụ na-akwa hie ụra. Nke a pụtara, n'okwu ya; ""Ọgwụ ụkwara anaghị ala ụkwara n'onwe ya."" Dọkịnta Mustafa kọwara na ọgwụ bụ iji mee ka ahụ juo onye ụkwara na-akwa oyi ebe ndị dibia ga-enye ya ọgwụ na-achụ nje butere ụkwara ahụ. Mana maka na ọgwụ ụkwara na-atọ ụtọ nke ukwuu ma nweekwa akụrụngwa na-emetụta ụbụrụ, onye na-enweghi ụkwara ṅụọ ya, ọd ị ya ụtọ n'ọnụ ma mee ụbụrụ ya adaa jụọ etu o si eme onye ụkwara na-akwa. Nke a kpatara onye ṅụchaa ya, ọ chọwa ọzọ, mana ọ bụ ọtọ m egbu m." afirika-53808441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53808441,Ihe di kwesịrị imere nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ,Ọ bụ naanị nne maọbụ nne di kwesịrị ile nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọmụgwọ?,"N'omenala Igbo, ọ na-abụkarị nne nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ maọbụ nne di ya - ma ọ bụrụ na nne ya anọghị - na-ele ya ọmụgwọ. N'ihi ọnọdụ a, ọtụtụ ụmụnwoke anaghị aghọta na e nwere ụzọ ole ha kwesịrị iji nyere nwunye ha aka. Nwaanyị bịara ọmụgwọ na-anọkarị ihe dịka site n'izuụka abụọ ruo ihe ruru ọnwa atọ; oge ọ nọ ya, ọ na-ebukarị ihe niile gbasara inyere ya bụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ aka n'isi. Mana gịnị ka nwaanyị a na-enyere aka ga-eme mgbe onye na-enyere ya aka lara? Ebe a ka nna nwa ọhụrụ ahụ kwesịrị iwelite isi, gbaa ajụ ma buru nwunye ya n'isi. Ị na-ajụ maka gịnị? Ọ bụ makana nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-achọ ohere ahụ ya ga-eji gbakee n'ihi ihe ọ gabigara n'ime ọnwa ole na ole o bu nwa n'afọ. N'ihi na ọ ka bụrụ ọrụ ya ịhụkwa na nwa ọ mụpụtara dị ndụ ma nwee ezigbo ahụike, ọrụ ya anaghị ebi n'ịmụpụta ya; ọ na-atarakwa ahụhụ na-aga n'ihu ma ọ bụrụ na ọ hụghị onye enyemaka. Mana dịka di ya, lee ihe ndị ị ga-emenwuru ya iji nyere ya aka: Ị ga-akwadonwu nwunye gị site n'ime ihe ndị a: 1) Nye onwe gị nri N'ọtụtụ ezinaụlọ, ọ bụkwa nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-esi nri enye ezinaụlọ ya, n'agbanyeghi na o nwereike ọ rahụghị ụra ọfụma n'abalị. Mana ị chọọ imere ya ihe ọma, nwanne biko sie nri nye gị na ndị ọzọ nọ n'ụlọ, maọbụ ị kpọrọ nwunye gị pụọ apụ gaa rie nri. Zụlatara ya nri maọbụ ị chọta onye ga na-esiri ya nri ruo mgbe ọ ga-enwekwa ike na-esi nri dịka o si emebu. 2) Lekọta nwa a mụrụ ọhụrụ Ọ bụghị nwa niile na-arahụ ụra n'abalị, oge onye niile na-arahụ ụra. Nke a na-eme ka ọ raa nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ahụ ịrahụ ụra ihe ruru awa isii ruo asatọ dịka o kwesịrị. Tinyekwuoro arahụghị ụra ahụ, ọ ga-enye nwa ara ma lekọtakwa ya ma n'ụtụtụ, ehihie, abalị, ọ na-esocha ebute ike ọgwụgwụ, ma nwekwaa ike ibute nsogbu ụbụrụ nke Bekee kpọrọ ""post-natal depression"". Ya mere gị bụ di ya kwesịrị ịgba mbọ lekọta nwa gị ụfọdụ oge iji nye nwunye gị ohere izuru ike ma rahụ ụra. 3) Gaa ozi n'ụlọ Nwa abụghị nke naanị ya, nyere ya aka kuru nwa unu mgbe ụfọdụ, nyere ya aka saa nwa ahụ, nye nwa nri ma ọ bụrụ na nwa malite isi na karama na-eri nri. Nyere ya aka hichaa ụlọ ma sakwaa akwa ụfọdụ oge. O nwee ebe ndị ọzọ ọ ga-achọ ka ị nyere ya aka, biko nwanne mee ya na-echeghi ya eche n'ihi na ọ ga-amasị ya nke ukwuu. 4) Wepụta otu ụbọchị lekọta ya: Ị chetara etu unu sibu arụkọ mgbe unu amụtabeghi nwa? Mee ka ọ mara na ọ ka bụkwa onye na-enye gị ọṅụ site n'imezi ya nke ọma. Kpọta onye ga-elekọta nwa unu, kpọrọ nwunye gị gaa ebe a ga-emezi ya isi, mbọ na ihe ndị ọzọ ụmụnwaanyị na-eji achọ mma. Kpọrọzịa ya gaa ebe unu ga-eri nri nakwa mee ụfọdụ ihe ndị unu na-emekọbu ọnụ tupu nwa unu abata ụwa. 5) Kwanyere ya ugwu: Ọ bụghị oge niile ka ọ ga-amasị ya ịkpa nkata mgbe ị chọrọ ịkpa maọbụ ịnọ ala gere gị ntị. Nke a akpasula gị iwe n'ihi na nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nwere ọtụtụ ihe na-aga ya n'isi nakwa na-eme ya n'ahụ. Ọ ka na-aghọta mgbanwe niile ahụ ya gabigara ma ka na-agabiga, ya mere nwanne biko nyetu ya ohere mgbe ahụ ma nyekwa ya ihu ma ọ chọrọ gị bịakwa. Ọ banye n'ụdịrị ọnọdụ a, gbaa ya ume, kwado ya, sị ya na ọ makazị. Kelee ya maka ịmụtara unu ọmalịcha nwa unu nwere. Na-ezitere ya ozi ga-eme ya obi ụtọ n'ekwentị ka ọ mara na ọ bụghị naanị ya kwụ." afirika-50557816,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50557816,Tekinụzụ '5G network' a na-abịa ọ ga-agbanwe ndụ gị?,"Dịka mmadụ na-eto n'ogodo na ndụ, etu a ka tekinụzụ banyere ekwentị a kpọrọ 'Network' sị eto nke ya sịte n'ọgbọ ruo n'ọgbọ.","E nwere ọgbọ ndị gụnyere nke mbụ (1G), abụọ (2G), atọ (3G), anọ (4G) na nke kachasị ọhụrụ nakwa ka a adị elu bụ nke ise (5G). Tekinụzụ '1G network' ruo na '4G network' nọ bu na Naịjirịa mana ugbua onyeisiala Buhari etinyeaka n'akwụkwọ ịnabata '5G network' na Naịjirịa. Ngwa gee ntị ka anyị kọọrọ gị ihe bụ tekinụzụ '5G network' na etu o si arụ ọrụ. Gịnị bụ '5G network'? Ọgbọ teknụzụ ekwentị ndị ọzọ e nwere gụnyere; Ọgbọ nke mbụ (1G) - Ọ na-anabata naanị iji okwu ọnụ (voice) ezirita ozi n'ekwentị. Ọgbọ nke abụọ (2G) - Na-abata okwu ọnụ na edemede (voice and text). Ọgbọ nke atọ (3G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo (mobile data). Ọgbọ nke anọ (4G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo dgz (mobile internet). I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??" afirika-45972077,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45972077,Nnamdi Kanu kọwaa etu ị si gbalarị Egwu eke - Uwazuruike,"N'ihe onyonyo na-efegharị na Facebook, onye ndu MASSOB bụ Ralph Uwazuruike kwuru ọtụtụ okwu banyere mpụtagharị Nnamdi Kanu.","Uwazuruike kwuru na ọ bụ ya bụ onye abụọ malitere ọgụ nnwereonwe Biafra ma a gụpụ Odumegwu Ojukwu. O kwuru na ọ bụ ntọala anọ bụ nke ọ hapụrụ ka Nnamdi Kanu na IPOB ji achụso nnwereonwe Biafra. Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ jụọ Nnamdi Kanu etu o si gbapụ n'ụlọ ya n'oge egwueke ahụ nke e gburu ọtụtụ mmadụ. N'okwu ya ""Kedụ etu Nnamdi Kanu siri gbapụ n'obodo Naịjirịa, kedụ ọdọụgbọelu, ọdọụgbọmmiri nakwa agbataobi o si gafee"" Uwazuruike kwuru na ajụjụ ndị a bụ ihe Nnamdi Kanu ji pụọ n'ala Naịjirịa gawa Izrel. Kirie ihe Uwazuruike kwuru n'uju n'olu Bekee: N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor etu Nnamdi Kanu si hapụ ụlọ ya gbafuo n'oge ahụ. O kwuru na ọ maghị etu Nnamdi si pụọ n'obodo Naịjirịa maka na ọ kọwabeghiri etu ahụ. Ejiofor kwuru ""Ihe dị mkpa bụ na Nnamdi Kanu dị ndụ ugbua, etu o si hapụ Naịjirịa pụọ, amaghị m"" Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ dịka Uwazuruike abụghị onye a na-asa okwu maka na onweghi aha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche" afirika-43705692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43705692,Ipob nabatara Buhari 2019,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ihe Ipob kwuru maka mpụtaghrị Buhari na 2019,"Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Rev. Chukwudi Peace sịrị na ya bụ ebụm n'ọbị Onyeisiala bụ ihe obi ụtọ nyere ha. Okwụrụ na Biafra ga abịa nkwankwa ma ọbụrụ na Buharị chịrị gawa. Na ọbụrụ na onye ọzọ chịwa, ihe dị mma, Igbo nwere ike ị da mba ọzọ. Ihe kọmiti ọkpe udo Ọhaneze chọpụtara Nnia Nwodo Onyeisi Ohaneze ndị Igbo sịrị na nsogbụ ụfọdụ ụmụnorobịa bụ nkata ezianụlọ Kọmitii Ohaneze ndị Igbo hibere maka ị lebe anya na-ọgbaghara na-ada n'otu ahụ a ekwuola na ọ bụ ndị isi ndị ntorobia na nke ụmụnwaayị oge ha zụgoro bụ ihe malitere ọgbaaghara na otu ahụ. Ode akwụkwụ kọmitii ahụ bụ Nze ọkpani Nkama kwuru nke a na mkparita ụka ya na BBC. Ohaneze ndị Igbo ga amalite ntụliaka ndị ntorobia nakwa nke ụmụnwaanyị ha na ọgụ ụbọchị nke Ọnwa bụ Epurelu. Ihe Russia kwuru maka ogbunigwe agbara na syria Agbara ihe a na-eche na ọ bụ ogbunigwe nuklea na Douma, ọdịda anyanwụ Ghouta nke Syria ụbọchị satọde Mba Russia ekwuola na ogbunigwe ahu atụrụ na Saria ụbọchị satụde bụ ogbuigwe nke nuklea. Minista Russia na ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Sergie Lavrov sị na onweghị ihe gosiri na ihe agbara ebe ahụ bụ ogbunigwe nke nuklea. Naịjirịa eritala otu ọla ọcha na egwuruegwu nke kọmọnwelt Ndị egwuruegwu 37 na ndị isi 4 ka Naịjirịa dugara egwuruegwu kọmọnwelt N'egwuruegwu, Naịjirịa enwetala otu ọla ọcha na egwuruegwu Commonwealth nke a na-eme na mba Australia. Mba India jị ọkpụ atọ were ọla edọ etinyere na egwuruegwu tenis. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka" egwuregwu-44172182,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44172182,Lee mba ndị meriri iko mbaụwa kemgbe e bidoro,"Ka asọmpi iko mbaụwa nke 2018 na-ebido, lee ndị buliri iko n'afọ ndị gara aga kamgbe e ji bido.","Ibuli iko mbaụwa bụ ihe e ji anya isi nye obodo ọbụla buliri ya A sọọla mpi ngwụcha iko mbaụwa ugboro 20, mana nke a ga-agba na mba Russia n'ọnwa Juun a ga-eme ka a mata ma mba ọzọ na-abụghị mba asatọ (8) buligoro ya a ga-ebutenwu ya. N'ime mba iri atọ na abụọ (32) ga-asọ mpi nke afọ, asaa n'ime ha ebuliela iko a n'oge gara aga, ebe Italy bụ ndị buliri ya na-agaghị abịa asọ mpi a. Lee mba ole buliri iko mbaụwa a. Germany: Joachim Low bụ onye nchịkọta ndị Germany oge ha buliri iko a ka bụ onye nchịkọta ha ugbua Germany ebuliela iko mbaụwa ugboro anọ. Ya bụ n'afọ 1954, 1974, 1990, 2014 Ugboro atọ ha buliri iko a bụ oge ha ka bụ mba a na-akpọ 'West Germany'. Ha meriri Argentina n'egwuregwu ngwụcha iji bulie iko nke afọ 2014. Nke a mere ha ndị Europe mbụ ga-ebuli iko mbaụwa n'ala ndị South America. Mba Brazil hibere asọmpi nke afọ ahụ. Germany ga-agba mbọ ịhụ ma ha a ga-ejidenwu nturuugo ha nwetara 2014 n'afọ 2018 a. Spain: Vicente Del Bosque bụ onye nchịkọta mba Spain oge ha buliri iko n'afọ 2010. Spain buliri iko mbaụwa n'afọ 2010. Ha buliri iko ka ha meriri Netherlands n'egwuregwu ngwụcha ha. Mba South Africa hibere asọmpi nke afọ ahụ. Italy: Marcello Lippi bụ onye na-achịkọta ndị Italy oge ha buliri iko na 2006 Italy ebuliela iko mbaụwa ugboro anọ, ya bụ 1934, 1938, 1982, 2006. Ha bụ nke abụọ na mba ndị kachasị bulie iko mbaụwa kemgbe e bidoro ya. Ha zutere mba France n'egwuregwu ngwụcha nke ha ji bulie iko nke 2006. Mba Germany hibere asọmpi nke afọ ahụ. Brazil: Luiz Felipe Scolari bụ onye nchịkọta Brazil oge ha buliri iko nke 2002 Brazil bụ mba kachasị bulie iko mbaụwa kemgbe e bidoro ya. Ha ebuliela iko a ugboro ise, ya bụ 1958, 1962, 1970, 1994, 2002. Ha bụkwa mba kacha sonye n'asọmpi a nke bekee kpọrọ 'participation', maka na enwebeghị asọmpi iko mbaụwa ha abịabeghị. Ha meriri mba Germany n'egwuregwu ngwụcha nke ha ji bulie iko nke 2002. E hibere asọmpi nke afọ ahụ na mba Korea na Japan. Carlos Alberto Parreira bụ onye nchịkọta Brazil oge ha buliri iko mbaụwa nke e hibere na mba America Brazil meriri Italy iji bulie iko nke 1994 e hibere na mba America. France: Aime Jacquet bụ onye nchịkọta France oge ha buliri iko Mba France buliri iko mbaụwa n'afọ 1998. Ha buliri iko ka ha meriri Brazil n'egwuregwu ngwụcha ha. E hibere asọmpi nke afọ ahụ na France ma bulie iko na be ha. Argentina: Diego Maradona bụ onye na-ewu ewu n'ihe gbasara bọọlụ so n'otu Argentina buliri iko mbaụwa n'afọ 1986 Mba Argentina buliri iko mbaụwa ugboro abụọ n'afọ 1978 na 1986. Ha buliri iko mbụ ha ka ha meriri Netherlands n'egwuregwu ngwụcha nke afọ 1978. E hibere asọmpi nke afọ 1978 n'Argentina ma bulie iko na be ha. E hibere asọmpi nke afọ 1986 na Mexico, ebe ha meriri West Germany n'egwuregwu ngwụcha. England: Bobby Charlton na Geoff Hurst so na ndị na-ewu ewu n'otu ndị buliri iko mbaụwa n'afọ 1966 Mba England buliri iko mbaụwa n'afọ 1966. Ha buliri iko ka ha meriri West Germany n'egwuregwu ngwụcha ha. E hibere asọmpi nke afọ ahụ n'England ma bulie iko na be ha. Geoff Hurst so n'otu England buliri iko mbaụwa n'afọ 1966, bụ onye a gaghị echefu echefu maka na ọ bụ naanị ya bụ onye nyerela goolu atọ n'ime otu egwuregwu a kpọrọ 'hat-trick', na ngwụcha iko mbaụwa. Uruguay: Alcides Ghiggia bụ naanị onye fọrọ ndụ n'otu Uruguay buliri iko mbaụwa n'afọ 1950 Mba Uruguay buliri iko mbaụwa ugboro abụọ; n'afọ 1930 na 1950. Ha buliri iko mbụ ha ka ha meriri Argentina n'egwuregwu ngwụcha nke afọ 1930. E hibere asọmpi nke afọ 1930 bụ nke Iko mbaụwa nke mbụ n'Uruguay ma bulie iko na be ha. Ha buliri iko nke abụọ n'afọ 1950 ka ha meriri Brazil, n'agbanyeghị na Brazil hibere asọmpi nke afọ ahụ. Kedụ onye ga-ebuli iko nke afọ a?" afirika-50886852,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50886852,Watford vs Man Utd: Osisi kpọrọnkụ a na-atụanya ọdịda nke dị ndụ ekwojiri,Ihere mere okwute taa ebe akwa kụwara akị ka ndị Watforf jiri ọkpụ abụọ menye Manchester United ihere taa bụ Sọnde.,"Paul Pogba dina ala mgbe a gbaturu ya Watford bu klasi premia lig n'isi nụrụ ya bụ ọgụ ka agụ ihụ na ha jituru Manchester United bụ ndị nke asatọ n'okpokoro lig. Agbanyeghị na Manchester United ji bọọlụ pesenti iri isii na anọ, ndị Watford ekweghị ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ya bụ mmeri gbagwojuru ọtụtụ anya maka na Mancherster United emeribuola ihe dịka asọmpị pesenti iri asaa na atọ (73%) bụ nke ha dachiri azụ ka ọ dị ha taa. Onyenkuzi Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer kwuru nke bụ eziokwu na-eleghị anya n'azụ. Okwuru na ""ndị otu m ekwesighị imeri ya bụ asọmpị maka na ha nọrọ ka ọgbọnọ site na mbido ruo na ngwụcha ya bụ asọmpi"". Okwukwara na otu ihe ahụ mekwara ndị Watford na mbido mana ha mechere ghọta onwe ha. Aron Wan-Bissaka, Harry Maguire na Juan Mata nke Manchester United ka egbuchiri bọọlụ Ole jakwara Paul Pogba ike na-ekwu na nlọhachite ya bụ uru dịịrị ndị otu ya maka na oji ike na uchu lohachite azụ, agbanyeghị na ahụghị ọkpa ya taa. Onye nyere penarịti ndị Watford bụ Troy Deeney kwukara na obi bụ ha sọ aṅụrị maka ya bụ mmerị mana nke a agaghị eme ka ọ baa ha isi. ""Anyị ga-agba mbọ ihụ na anyị adachighị azụ, maka na ndị mmadụ che na anyị ga-agharịpụ"". Watford ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester United na ya bụ asọmpi. Ismaila Sarr ji bọolụ ebe Luke Shaw na-eduga ya ozi Ismaila Sarr nke mba Senegal mukere ka kpakpando ta dịka nyere goolu nke mbụ ndị ka onyere aka nwete penariti ahụ nke Deeney nyere. Nke a bụ goolu nke abụọ ya kemgbe amalitere sizin a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43538468,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43538468,Okwu Naịjirịa na Boko Haram ọ ga-akwụsi agha?,Okwu na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua bụ na ndị Boko Haram na gọọmentị Naịjirịa na akpakọrita uka banyere etu a ga-esi were belata maọbụ kwụsị mgbọ a na-akwa n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.,"Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Nke a bụ mbụ gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ya na Boko Haram na-akpakọrita ụka na nsọ a. Onye kwuru maka olileanya a bụ Lai Mohammed, bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi. Akpam ike Boko Haram, n'agha Naịjirịa na-ebuso ha egbuola mmadụ puku kwuru puku kemgbe 2009 nsogbu a bidoro. Mana ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari na-ekwu na mbụ na ọ ga-amasị ha ka akpakọrịta ụka. Lai Mohammed kwuru n'ozi o zigara ndị ntaakụkọ iji kọwa etu e siri gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi na,""Ọtụtụ mmadụ amaghị, mana anyị na-akpakorịta ụka ịhụ ma anyi na ndị ọlụọla a aga-ekweta ka akwụsịlata ịkwa mgbọ."" Ndị Boko Haram kpọlatala ụmụaka ahụ n' ụbọchị 19 nke Febụwarị. Ụmụaka ise nime ụmụ Dapchi ahụ nwụrụ oge a kpọrọ ha Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ise n'ime ha nwụrụ ka e ji ha, dịka aka ka ji otu onye n'ime ha. Mohammed kwuru na nkwụsịlịta ịkwa mgbọ nke izuụka bidoro n' ụbọchị Maachị 19 nke afọ a nyere ohere iji kpọlata ụmụaka a. Akwụkwọ ozi Mohammed kọwara na ọ bụ mmadụ 111 ka a tọọrọ na Dapchi, nke bụlitere ọnụọgugụ ndị a tọrọ site na 110 ha kwuru na mbụ. Akpọghachịrị ụmụaka Dapchi ahụ oge ụka ka ha siri Abuja ebe ha gara ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari lọta.` Nkewa dị na Boko Haram Mohammed Kwuru, ""Anyị nwere ohere itinye ọnụ n'okwu ndị ọzọ mgbe a tọrọ ụmụ Dapchi."" O mechara gwa ndị ntaakụko Reuters n'ekwentị sị:""Ihe anyi na-ele anya bụ ka igba egbe a kwụsị kpam kpam."" Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Mana, amaghị otu Boko Haram nke ha na gọọmentị Naịjiria na-akpakọrịta ụka ugbua. Al-Barnawi bu onye a na-eche na ọ bụ nwa Mohammed Yusuf, bụ onye bụ isi sekpụ ntị na Boko Haram bụ onye a na-eche na ọ bụ ya kpara ike Dapchi, ebe Abubakar Shekau bụ onye na-achị otu Boko Haram ọzọ. BBC gbara otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Maazị Chris Kehinde Nwandụ ajụjụ ọnụ gbasara ihe gọọmentị kwesịrị ime. Maazi Nwandu kwuru na okwu a Naijirịa na Boko Haram na-ekwu abaghị uru cha cha, maka ndị Boko Haram akwụsịgbeghị ike ha na-akpa. Okwu Chris Nwandu maka ""ceasefire"" Nsogbu gbasara Boko Haram aghasaala mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke ugwu Naịjirịa kamgbe o bidoro n'afọ 2009. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50948572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50948572,Ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya mana olileanya a tipiara etipia - Onye ọrụ Enugwu steeti,Ụbọchi 31 nke Disemba 2019 bụ ụbọchị ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naijirịa bụ 'Nigerian Labour Congress' (NLC) nyedebere steeti niile na Naijirịa ka ha kwụwa ụgwọ opekatampe.,"Mana dịka ụbọchị ahụ na-erute nso, Enugwu steeti na Anambra steeti so na ndị ebidobeghị ịkwụ ya. N'otu aka ahụ, ka ndị ọrụ steeti ahụ sị na ha ji nwayọ eme emume ekeresimesi nke afọ a makana ego adịghị. Onye nkuzi na mahadum Enwugwu steeti bụ Mazi Nnamdi Okenwa, kwuru na o cheghị na e nwere steeti na Naijirịa mezuru ihe gbasara ụgwọ opekatampe nke ga-erute ndị ọrụ gọọmentị ruo agba nke iri na isii. O kwukwara na n'agbanyeghi na gọọmentị Enugwu steeti kwụrụ ụgwọ ọnwa nke ọnwa Disemba ma tụkwasịkwa ya ọnwa ọzọ nke e ji 'ụgwọ ọnwa iri na atọ' mara, na ha ekwubeghị okwu ịkwụ ụgwọ opekatampe. Ọ kọwara na gọọmentị etiti emebeghị ihe ha kwesịrị ime iji hụ na gọọmentị steeti ahụ ga-akwụnwu ya bụ ụgwọ. Ọ kọwakwara na a kwụọ ụgwọ opekatampe a, na o nwereike ime ka ego ihe dị n'ahịa laa elu nke ndị bekee na-akpọ 'Inflation'. Nnamdi Okenwa kwukwara na ya alaghị obodo maka ekeresimesi n'ihi na ego adịghị. O kwuru na ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya kama olileanya a tipịara etipịa. Ihe ndị 'NLC' Anambara nwere ikwu Mgbe BBC kpọrọ onyeisioche ndị ngalaba 'NLC' nke Anambara steeti bụ Jerry Nnubia, o kwuru na mgbe ha na gọọmentị Anambara zutere, na ha anabataghị ihe gọọmentị kwuru maka ụgwọ opekatampe. Nnubia sị na ha na-eche ka gọọmentị zaa ha dịka ha siri kwuo. O kwukwara na ha ga-akpọtụrụ gọọmentị taa bụ ụbọchi 30 nke ọnwa Disemba 2019, ma ọ bụru na gọọmentị emeghị ihe ha kwesịrị ime na ha ga-ezute were kpebie ihe ha ga-eme echi bụ ụbọchị (31 nke Disemba) ikpeazụ ha nyere gọọmentị ikpebi ịkwụ ụgwọ opekatampe. Ihe ndị 'NLC' nke Enugwu steeti nwere ikwu Onyeisi ngalaba ndị NLC nke Enwugwu steeti bụ Nwobodo Virginus, kwuru na a ga-enwe ọgbakọ ngalaba e hiwere maka ịkwụ ụgwọ opekatampe n'Enugwu steeti nke gụnyere ndị ọrụ gọọmentị na ndị otu NLC na mgbede Disemba 30, 2019. O kwuru na ọ bụ mgbe ha nwechara ọgbakọ a ka ndị otu NLC ga-ama ihe ha ga-eme. Nwobodo sị na ọ nọghị na ngalaba a ehibere maka ikwụ ụgwọ opekatampe a. Ọnọdụ gọọmentị Anambara steeti maka ịkwụ ụgwọ opekatampe Onye kwuchitere gọọmentị Anambara steeti bụ Don Adinuba, gwara ndị ntaakụkọ BBC na gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano, gwara ndị ọrụ gọomentị steeti ya mgbe ha na-eme emume maka ncheta ndị ọrụ gọọmentị nke ha mere n'ụbọchi 16 nke Disemba 2019, na gọọmentị ga-akwụ ụgwọ opekatampe. Adinuba kwuru na gọomentị Anambara steeti ga-akwụ ụgwọ opekatampe nke N30,000 site n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2020. O kwukwara sị ""gọomentị ga-ebuli ụgwọ mmadụ niile na-arụrụ ha ọrụ"" . O kwuru na gọomentị Anambara dị njikere ilekọta ndị ọrụ ha dịka ha kwụrụ ha ụgwọ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba, ma bunye ndị ọrụ ha niile otu akpa osikapa." afirika-47117513,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47117513,APC Rivers: Ụlọikpe Mkpegharị ewezụgala ikpe wepụrụ ha n'ọsọ ọkwa gọvanọ,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe mkpegharị emela mkpebi ọhụrụ banyere arịrịọ otu pati APC nke Rivas steeti rịọrọ maka ikpe kagburu ntuliaka imeụlọ ha.,"Ikpe ahụ nke ụlọikpe ukwu wepụtara na mbụ kagburu ntuliaka imeụlọ APC ma nye INEC iwu iwepụ aha pati APC na ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ. Mana ụlọikpe mkpegharị kpegharịrị ikpe ahụ na Pọtakọt bụ isi obodo Rịvas steeti taa bụ Monde. Ha kpebiri ka a ghara ime ihe ọbụla banyere ikpe nke mbụ ụlọikpe nta wepụtara nke a kpọrọ 'Stay of Execution' na Bekee. Mkpebi ọhụrụ a nwereike imetụta mmachị ahụ ụlọikpe nyeeburu Inec banyere itinye aha onye ọbụla dịka onye ga-azọ ọkwa n'okpuru APC na Rivas steeti. Chitzi Ogbumgbada bụ ọkaiwu gwara BBC na ikpe a so ikpe abụọ Magnus Abe bu onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC na Nyesom Wike bụ gọvanọ na-achị Rivas steeti ritere n'ụlọikpe ukwu na Pọtakọt n'afọ 2019 nke machiri APC iwepụta mmadụ ịzọ ọkwa gọvano na steeti ahụ. Ọ sị; ""nke a mere ka Inec wepụ aha ndị niile na-azo ọkwa n'okpuru APC na Rivas na ntuliaka 2019."" Mana Tonye Cole, bu onye nke ọzọ na-azọ ọkwa n'okpuru APC gara rịọ ụlọikpe mkpegharị ka o wezuga ikpe a. Ogbumgbada kwukwara; ""Ikpe a nwyere ihe abụọ. Ikpe Tonye Cole hibere maka ikpe Ụlọikpe Ukwu nyere kwesiri ịga n'ihu eche, mana nke taa nwereike kagbuo ya. Ụlọikpe mkpegharị abụghị ejechaa ọ gwụ n'ihe banyere ikpe ndọrọndọrọ ọchịchị. E nwereike were ya gawa ụlọikpe mkpecha nke Bekee kpọrọ ""Supreme Court""." media-47732784,https://www.bbc.com/igbo/media-47732784,Cardi B: Lee ihe ndị 'celebrity' bụ tupu ha achakee,Ụfọdụ ndị ama ama tara ahụhụ na nwata tupu ha abụrụ ihe ha bụ ugbua.,"Ndí ama ama na Naíjiría Ụfọdụ sị n'ezinaụlọ kpara ogbenye ebe ndị ọzọ si n'ezinaụlọ bụ akajiakụ. Ọtụtụ mmadụ amaghị ihe ụfọdụ gabigara tupu ha abụrụ ihe ha bụ ugbua. Cardi B nke mba Amerika kwuru na ya gbara akwụna nke ndị na-agba egwu a na-akpọ ""stripper"", ma zuo ụfọdụ ụmụnwoke ohi, tupu ọ bụrụ ihe ọ bụ ugbua; bụ otiegwu a na-anụ aha ya na mbaụwa. Cardi B bụ ""nwamgbọtọ"" tupu ọpụta ihe Ụzụ Cardi B na-atụ maka na akụkọ kọrọ na ọ bụ onye ọgba ọtọ na-atụrụ ụmụnwoke ego tupu ọ bụrụ onye ama ama. Mana ọ bụghị naanị Cardi B bụ onye a ma ama nwere akụkọ ihe mere ochie. Ya kpatara anyị ji tinye anya ịmata ihe ndị ama ama ndị ọzọ mere iji rute ebe ha rutere ugbua. Lee akụkọ a na-atule ụfọdụ n'ime ha: Jay Jay Okocha Jay Jay Okocha bughariri ojoko (Plantain} mgbe ọ dị na nwata. Jay Jay Okocha Bobmanuel Udokwu Bobmanuel Udokwu onye a na-agbankiri Bobmanuel Udokwu bụ onye ama ama maka ihe onyoonyo so nna ya azụ ahịa na Main Market Enugwu tupu ọ banye Nollywood. Bobmanuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa Otiegwu Buchi Enyioma Atuonwu (Buchi) Onye egwu Enyioma Atuonwu (Buchi) bụ onye otu nzuzo tupu o chegharịa ma jirizie egwu na-agbasa oziọma. Ọ bụkwa onye ""obioma"" dụọdụọ na-akwa akwa. Ọ bụkwa onye nkụzi na Mahadum Legọs. Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a Frank Edward Frank Edward onye egwu Frank Edwards bụ onye mgbere mgbe ọ dị na nwata. Frank Edwards: Ọ bụghị egwu ka m kwadoburu ịgụ Paul Okoye Paul Okoye onye egwu Paul Okoye na nwanne ya Peter rere bụredị Ego adịghị mgbe anyị na-eto- Paul Okoye Mr Raw Mr. Raw onye egwu Mr. Raw mụrụ mekanik. O rekwara ncha gbakwa ọsọahịa na Coal Camp Enugwu. Mr Raw: Ihe mere m jiri e ji Igbo eme 'rap' Victor Osuagwu Victor Osuagwu Victor Osuagwu buru aja na mmiri mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Akụkọ ga-amasi gị:" afirika-45797245,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45797245,Akụkọ kachasị na mgbede: Ndị IS gburu ndị agha Naịjirịa asaa - Ndị agha,Akụkọ dị mkpa taa Mwakpo ndi Islamic State mere ndi agha Naịjirịa,"Ndị oyi egwu akpọrọ Islamic State nke Bekee ekwuola na ha gburu ndị agha Naịjirịa ruru iri atọ na otu ma nwuchie mmadụ isi na mwakpo ha mere na obodo Kangarwa dị na Borno. Okwu pụtara na ozi ndị IS zipụrụ ụnyaahụ. Ndị agha Naịjirịa kwuburu na ha na ndi omekome a kwara isi nwanne ụnyaahụ na Kangarwa na Arege, mana ha ekwughi maka ndị ometụtara. Mana taa, ndị agha Naịjirịa dekwara na twitter na ọ bụ ndị otu asaa nwụrụ ka iri na isi merụrụ ahụ. End of Twitter post, 1 Ndị agha kwụkwara na ha nọ na usoro ime ka ndị nwe ndị a nwụrụ mata ihe mere ndị be ha nakw inye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwo. Gọọmentị ekwerela ịkwụ ndị ọrụ N24,000 Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa Minister na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na agbanyeghị na gọọmentị etiti kpebiri ịkwụ ndị ọrụ ha opekatampe ụgwọ ọnwa puku naira iri abụo na anọ, nke steeti, puku naira iri abụọ nke, Ngalaba na-ahu maka ndi ọrụ bụ NLC chọrọ iri atọ. Ọ si na akụkọ na ha ekwerela ịkwụ puku iri atọ abụghị eziokwu Ihe Pope Francis kwuru maka ite ime N'oge gara aga Pope Francis kwuru megide ịma mmadụ ikpe ọnwụ Onyeisi ndị ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na ite ime dịka ịkwụ mmadụ ụgwọ ka ogbuoru gị mmadụ. Okwu Francis a bụ nke kachasi sịe ike kemgbe o bidoro tinyenwe ọnụ n'ihe gbasara ite nwa. Onye nchikọta ndị otu bọọlụ Libya agbaala arụkwaghịm Adel Amrouche sị na ya adị emezi Onye nchikọta ndị asọmpị bọọlụ mba Libya akwakọrọla lawa n'ihu egwuregwu bọọlụ mba ahụ na nke Naịjirịa ga-agba maka ima onye ga-etozu oke iko mba Afrika nke afọ na abịa Adel Amrouche bụ onye mba Belgium kwuru na ọ bụ mgbawa obi ọnọdụ ọrụ ya mere ya jiri kwakọrọ nawa Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa APGA: Ndị Imo tunyere pati APGA na ntuliaka 2019 INEC emapụla APC na Zamfara iso mee ntuliaka 2019 Ndị mmadụ na ebo INEC ebubo amaghị eme maka mpụtara ndọrọndọrọ Osun steeti na ebe ndị ọzọ Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjịria a kpọrọ Inec amachiela APC na Zamfara Steeti ịwepụta ndị ga-azọ ọchịchị na steeti ahụ. Inec sị mmiri ribidodoro APC Zamfara maka ịweta akwụkwọ ndị nọchite anya ha. Buhari chọrọ ịgba mbibi ego ọzọ Onyeisiala Naijiria bú Muhammadu Buhari,chóó ízó ókwa onyeisiala na ntuliaka na-abía na Febúwarí 2019 Onyeisiala Muhammadu Buhari entinyela akwụkwọ ka ndị ụlọ omeiwu nye ya ikike ibitekwu ego ọzọ na mba ofesi. Buhari na-arịọ ka ya bite ego karịrị ijeri dọla abụọ nke ọ ga etinye ụfọdụ n'ime n'ọrụ n'afọ a. Stella Ogonna Okpaleke akwụọla ụdọ na Gana Ndị igbo na azụ ahịa na Gana na ahusi anya kemgbe gọmenti obodo ahụ malietere ịhazigharị azụmagha obodo ahụ Nwaanyị Igbo akwuọla ụdọ na Gana dịka e mechichara ahịa ebe ha na-azụ ahịa na mba ahụ. Otu jikọrọ ndị Naijiria na azụ ahịa na Gana kwuru na Ọrịakụ Stella Ogonna Okpaleke, onye ji ụmụ atọ kwụrụ ụdọ ka emechịchara ọdọahịa ya na mba ahụ. Ndị ụka asaala Lauretta Onochie Igwurube mmadụ pụtara maka ngagharị iwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa Otu jikọtara ndị ụka Kristi niile bụ CAN azachiele ojeozi onyeisala Buharị na Soshal midia bụ Lauretta Onochie na ebubo o boro onyeisi ha bụ Samson Ayokunle. CAN kpọrọ Lauretta 'efulefu' maka ibo onyeisi ha ebubo mpụ. IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị IMF ụlọakụ mbinye ego mba ụwa IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị ka ha ghara ịkpụ ụkwụ n'ala maka ịhazịgharị akụnụba alla anyị dịka ọnụ mmanụ agbị na-arị ugbua. N'aka ọzọ, Hillary Clinton akpọọla ndị pati democrats n'ụlọomeiwu Amerika ka ha nyocha agwa onyeisiala Donald Trump n'usoro ntuliaka 2016 na mba ahụ. Ụwa a gbaa Black Stars gharị Black Stars dachiri azụ na ruo 51 na oche ndị FIFA N'egwuruegwu, ka ọ dị ugbua, Gana amabeghị ka asọmpị ha ndị Sierelionu nwere ụbọchị Tọzde aga enwe isi. Cheta na FIFA machiri Sierelionu maka gọọmenti ha ịtinye aka na ọchịchị egwu bọlụ mba ahụ. Gee nkeji nke ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala? Akụkọ ga-amasị gi" afirika-50103752,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50103752,Nigeria's oldest prisoner: Nwoke dị afọ 100 a maburu ikpe ọnwụ anwụọla,"Chisom nwa Celestine Egboluche gwara BBC Igbo na nna ya kubiri ume n'abalị 18 nke ọnwa Ọktoba 2019, n'ụlọ ya na Pọtakọt.","Paul Egboluche (nwa) na Celestine Egboluche (Nna) Chisom kwuru na tupu nna ya anwụọ, na ọ narala ya nri rie ọfụma (ọ naghị eribu nri ọfụma ka o si ụlọọgwụ lọta), mana o rughi otu awa o richara nri ahụ, o kubie ume. Chisom kwuru na ọ na-eche na ọ bụ obi mgbawa mere nna ya ji nwụọ mgbe ọ nwụrụ, n'ihi na ọ jụgidere ese nwa ya nwoke bụ Paul a tụrụ ya na ya nga, ruo mgbe ọ nwụrụ. O kwuru na o legidere anya ịhụ Paul bụ onye a hapụrụ n'ụlọmkpọrọ ka a tọghapụrụ ya, mana ọ hụghị ya ruo n'oge ọnwụ ya. Chisom kọwara etu nna ya si na-ajụkwa ese nwunye ya, na-amaghị na ọ nwụrụ kemgbe afọ 2015 (maka ọnọdụ ya, o kweghị agwa ya na ọ nwụọla). Celestine jụkwara ese nwa ya nwoke nke abụọ, na-amaghị na Chisom na onwe ya ahụbeghi ya anya kemgbe afọ 2015. Chisom kwuru na ya magahị ma nwanne ya nwoke ahụ ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. O kwuru na nna ya gbakechaghịkwa n'ọrịa a nọ na-agwọ ya ka o si n'ụlọmkpọrọ pụta, tinyekwuo afọ ole ọ dị (100), nke mere ka ọ ratụ obere ahụ ịnabata ọgwụgwọ ọfụma. Mgbe Celestine pụtara n'ụlọmkpọrọ n'ọnwa Juun 2019 Etu obi dị Chisom Chisom kwara arịrị maka etu nwụchi nna ya si tụgharịa ihe niile gbasara ndụ ha. O kwuru na a nwụchiri Celestine n'afọ 2000, mgbe Chisom ka dị naanị afọ 15, nke mere ka ọ ghara ịgụchapụ akwụkwọ, wee kwụsị na nke Bekee kpọrọ JSS2. O kwukwara na ndị obodo ha n'Amachara dị n'Owerre-Akọkwa dị n'Imo steeti, gara kutuo ụlọ nna ya, nke bụ na ugbua, amabeghi ebe a ga-eli ozu Celestine. Ihe ị kwesịrị ịma maka Celestine dịka nwa ya nwaanyị si kwuo Chisom na onwe ya na-arịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ Paul nwanne ya makana ọ bụ naanị ya ka ọ fọzịrị ya. Ọ na-ekwukwa na ọ ga-amasị ya ka e lie nna ya n'obodo ha n'Akọkwa ebe ọ na-akọwa na ọ dịzị ka ebe ama ha shiri. Akụkọ ga-amasị gị:" media-48509916,https://www.bbc.com/igbo/media-48509916,Umahi vs Fulani herdsmen : Ndi Ugwu asaala Govanọ Umahi ebubo iwakpo ụmụnwaanyị Ebonyi,Ndi ndu ndị Ugwu bi n'Ebonyi ekwuola na ha na ndị Ebonyi na-ebi ka otu ezinaụlọ.,"Okwu a na-apụta dịka Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi tiri mkpu maka mwakpo na mmetọ ndị Fulani ọchịehi na-emetọ ụmụnwaanyị steeti ahụ ma nye iwu ka ndị a na-arụ aka pụọ n'obodo ahụ. Ihe butere iwu ahụ bu mwakpo onye ọchịehi wakporo otu nwaanyi n'ike n'ụlọ di ya n'Isu dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha na steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuchitara Govamentị Ebonyi Steeti bu Emanuel Uzor gwara ndị BBC na omume a jọgburu udele ma sigbuo nkapi kọwara na dịka omenala ndị Isu si we dindị ọchịehi ka akwapụ n'obodo ha ka ha nwee ike ikpụ arụ maka igbochi ọdachi, e meghị otu ahụ mmadụ ga-ebido nwụwa n'obodo ahụ. Ọ rụtụrụ aka na e wezụga ihe a mere, na ndị ọchịehi na ndị ọrụubi n'Ebonyị steeti na ebikọrita n'udo. Mgbe BBC gbara onyeisi ndị Miyetti Allah n'Ọwuwa Anyanwụ bụ Alhaji Gidado Sidiki ajuju maka iwu gọvano nyere ka ndi ọchiehi a na-arụ aka n'ebubo ịwakpo ụmụnwaanyị puo n' Izzu na Isu dị n'okpuru ochichi Ọnịcha, ọ gwara BBC na e kpeziela nsogbu ahụ izu abụọ gara aga oge e nwere ọgbakọ ndị ihe ahụ metụtara. N'okwu gbasara kepukepu na ndị Fulani na-apị mbazụ ịwakpo ala Igbo , Sikkidi kwuru n'akụkọ ahụ bụ ""akụkọ ụgha."" ""O nweghị mgbe otu Miyetti Allah jiri kwuo ụdị okwu a."" "" Anyị na ndị gọvanọ na ndị Ọwụwa-Anyanwụ dị n'ezi mma."" ""Nke a bụghị iji kwuo na e nweghị ebe ndị e nwere nghọtahie mana na ime nghotahie ndị a, e nwere ndozi nke wetara udo."" N'otu olu ahu, Alhaji Isa Beko bụ onye isi ndị Ugwu na mpaghara Afikpo kwuru na ndị be ha na ndị Ebonyị na-ebi n'udo. Ọ gara n'ihu kwuo na udo dị n'etiti ndi ọchiehi na ndị Ebonyi adịwala tupu alụọ Agha. Akụkọ ga-amasị:" afirika-56221181,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56221181,"Tonto Dikeh: Ọ bụghị eziokwu na anyị nyere nwa ada a ọkwa 'Ambassador"" - NCPC","""Tonto Dikeh abụghị 'ambassador' anyị, onweghị mgbe anyị ji nye ya ọkwa dị otu a.""","Tonto Dikeh na onyeisi ngalaba NCPC bụ Yakubu Pam Nke a bụ okwu si n'ọnụ Celestine Oguguo Toruka, onye isi mgbasa ozi na ngalaba gọọmentị a kpọrọ 'National Christian Pilgrims Commission'. Celestine Oguguo kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo n'ụtụtụ Satọde gbasara akụkọ na-ewu na soshal midia ugbua nke na-ekwu na Tonto Dikeh, nwa ada na-eme ejije Nollywood, enwetala ọkwa 'Ambassador' nke udo n'aka ụlọọrụ NCPC. Etu akụkọ a si malite Tonto Dikeh dere n'akara soshal midia ya dị icheiche na ya abụrụla onye na-anọchite anya ngalaba NCPC n'ịkpa udo. Ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ dị icheiche buru ya bụ akụkọ, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji malite ịkatọ ya bụ ihe. Mark Amaza na-ajụ ihe kpatara e ji hapụ ndị otu Kraịst a ma ama, họrọ Tonto Dike dịka onye nnọchite anya NCPC Lee ihe NCPC kwuru Celestine Oguguo Toruka, onyeisi mgbasa ozi na NCPC gwara BBC Igbo na ya bụ akụkọ abụchaghị eziokwu. O kwuru na Tonto Dikeh nakwa ụlọọrụ ya bụ 'Tonto Dikeh Foundation' bịara njem nleta n'isi ụlọọrụ NCPC dị n'Abuja, mana onweghị mgbe e ji nye ya ọkwa ọbụla ma ya fọkwa 'ambassador'. Yakubu Pam bụ onyeisi ngalaba NCPC ""Ọbụghị NCPC kpọrọ ya oku ka ọ bịa, ọ bụ ya na ndị ụlọọrụ ya bịara we kwuo na ọ ga-amasị ha ịkwado ọrụ anyị,"" Celestine Toruka na-ekwu. ""Tonto Dikeh kwuru na ọ ga-akwado mmadụ iri ka ha soro gaa njem n'ala nsọ n'afọ a. O kwukwara na ọ ga-akwado mbọ NCPC na-agba iweta udo na Naịjirịa."" ""Onyeisi NCPC bụ Yakubu Pam nabatara ihe o kwuru ma kweta na ụlọọrụ anyị na ụlọọrụ ga-ejikọ aka n'ọrụ ụfọdụ anyị na-arụ."" Celestine Toruka gara n'ihu kwuo na ọ gbara ya gharịị ịhụ na soshal midia ebe Tonto na-ekwu na e nyere ya ọkwa Ambassador. ""Nke a abụghị eziokwu."" Ihe Tonto Dikeh kwuru Mana Tonto Dikeh na-ekwusi ike na NCPC nyere ya ọkwa Ambassador. N'akara Instagram ya, o wepụtara ozi nke na-ekwu na ọ bụ ndị mmadụ gbara mgba okpuru mere e ji napụ ya ọkwa ahụ. Tonto kwuru na ya agaghị asịgide mmadụ maọbụ ụlọọrụ ọbụla asị. O kwukwara na ya nwere ihe onyonyo iji gbaa akaebe maka ihe ọ na-ekwu, mana ọ gaghị ewepụta ya." 49734140,https://www.bbc.com/igbo/49734140,Champions League Results: Njọ ahịa akpọọla Chelsea na Liverpool ihu,Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Liverpool ejirila njọ ahị malite asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020.,"Otu bọọlụ Valencia si mba Spen wee bịa were otu ọkpụ goolu gbachie ndị Chelsea ọnụ. Ebe otu Napoli nke mba Ịtali jị ọkpụ goolu abụọ asataghị asata gwa ndị Liverpool na nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ. Liverpool bụ ndị buliri iko Champions League nke afọ 2018/2019. Ndị ọkacha mara na-ekwukwa na igwe 'Video Assissted Referee' (VAR) kwesịrị ịkagbu penariti Valencia ji nye Liverpool goolu nke abụọ. Mana ọtụtụ kwuru na Liverpool jiri ụkwụ a gawa, ọdịghịkwa ka e nwere ihe ga eru ha aka n'afọ a. N'aka nke ọzọ, Chelsea nwetara ohere ịsa otu ọkpụ goolu Valencia nyere ha, mana Ross Barkley gbafuru penariti e nyere ya na nkeji iri itoolu na ụma. Nke ka njọ bụ mgbe Mason Mount merụrụ ahụ wee tụrụ ụkwụ pụọ. N'asọmpi Champions League ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuuzde, Barcelona na ndị Borussia Dortmund gbara onwe ha onye lawa onye lawa. Lionel Messi so Barcelona gbaa taa, mana nke a enyeghị ha mmeri. Ajax ji ọkpụ goolu atọ nyụọ ndị Lille nke mba Fransị ịkpakwụ. Ndị RB Salsburg ji ọkpụ goolu isii asatara abụọ menyụọ ndị KRC Genk anya. Lyon na Zenit St Petersburg nyere onwe ha ọtu ọkpụ otu ọkpu. Ebe Inter Milan na Slavia Prague gbakwara otu ihe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo" afirika-46428641,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46428641,Nigeria Election 2019: Ndị na-azọ ntuliaka na osote ha,Lee mmadụ isii na-azọ ọkwa onyeisiala ndị mmadụ kacha anụ aha ha na ndị osote ha:,"Ka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ ""Independent National Electoral Commission (INEC)"" bipụtara akwụkwọ gosiri na ihe karịrị mmadụ iri asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019, BBC Igbo chọrọ igosi gị ndị nke aha ha kacha ada ụda. N'ime mmadụ isii a na ndị osote ha, e nwere ụmụnwaanyị atọ n'ime ha; otu na-azọ onyeisiala ebe ndị ọzọ na-azọ osote. 1) Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo Buhari na Osinbajo achịala Naịjirịa kemgbe afọ 2015 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC) Onye bụ Muhammadu Buhari? Onye bụ Yemi Osinbajo? 2) Atiku Abubakar na Peter Obi Atiku na Obi na-efe ọkọrọtọ Peoples Democratic Party (PDP) na ntuliaka 2019 a Onye bụ Atiku Abubakar? Onye bụ Peter Obi? 3) Oby Ezekwesili na AbdulGaniyu Galadima Galadima bụkwa onyeisioche otu pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) ha chọrọ iji zọta ọchịchị Onye bụ Oby Ezekwesili? Onye bụ Ganiyu Galadima? 4) Kingsley Moghalu na Umma Getso Moghalu na Getso na-azọ ọkwa n'okpuru pati Young Progressive Party (YPP) Onye bụ Kingsley Moghalu? Onye bụ Umma Getso? 5) Omoyele Sowore na Rabiu Ahmed Rufai Sowore na Rufai na-azọ ọkwa n'okpuru pati African Action Congress (AAC) Onye bụ Omoyele Sowore? Onye bụ Rabiu Ahmed Rufai? 6) Fela Durotoye na Khadijah Abdullahi-Iya Durotoye na Abdullahi-Iya na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN) Onye bụ Fela Durotoye? Onye bụ Khadijah Abdullahi-Iya? Kedụ onye ị ga-atụnyere?" afirika-49785913,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49785913,Marriage Proposal: Nwoke lakpuru n'ime mmiri ịjụ enyi ya nwanyị ya maka ọlụlụ emiela na mmiri ahụ,Akụkọ na-agba anya mmiri mere dịka nwoke onye mba Amerịka mirilara na mmiri ka ọ na-ajụ ọyị ya nwaanyị ma ọ ga-alụ ya n'ime mmiri ahụ.,"Ndị uweojii Zanzibar na-enyocha etu Weber si nwụ Steven Weber na ọyị ya nwaanyị, Kenesha Antoine gara nọdụ n'ụlọ oriri na nkwarị dị n'okpuru mmiri nke dị na Manta Resort, n'akụkụ Pemba Island na mba Tanzania. Ihe nkiri ọyị ya nwaanyị bụ Antoine wepụtara gosiri ka Weber si makpunye n'ime mmiri ahụ, wepụta akwụkwọ ebe o dere ya bụ arịrịọ nakwa ọla aka mana tupu Antoine asacha ajụjụ ọlụlụ, mmiri agbagbuola enyi ya nwoke. Ọyị ya nwaanyị depụtara maka ọnwụ ya na soshal midia (Facebook) kwuru na ọ pụtaghị na mmiri ahụ tupu ọ nwụọ. Onyeisi ụlọ oriri na nkwari ahụ bụ Matthew Saus kwuru na ọnwụ Weber wutere ma nye ndị ụlọọrụ ya ahụ ọmajiji. Ndị uweojii Zanzibar na-enyocha etu Weber si nwụ O kwuru na mgbe ndị ụlọọrụ ya ji chọpụta ihe na-eme, ihe e mebiela nke ukwu. Etu o si mee? Mazi Weber na ọyị nwaaanyị hazichara etu ha ga-esi wee rahụ n'ụlọ ndịna dị n'ụlọ nkwarị ahụ dị n'okpuru mmiri rue abalị anọ. Ụbọchị nke atọ, ọ gawa ịrịọ ọyị enyi ya nwaanyị ma ọ ga-alụ ya n'okpuru mmiri. Kenesha na Weber gara njem nleghari anya mgbe ọdachị a mere Ka o na-eme nke a , o yi ugogbe anya e ji egwu mmiri, jide akwụkwọ o ji dee ya bụ arịrịọ nọrọ n'akụkụ mpio ebe ọyị ya nwaanyị nọ n'ime ụlọ ndịna ha na-esete ihe o na-eme. Ihe e edere n'akwụkwọ ahụ Weber ji pụtara bụ nke a: ""Enweghị m ike ijide ume m oteaka iji gwa gị ihe niile mere m ji hụ gị n'anya, mana... Ihe niile m hụrụ n'anya n'ebe ị nọ. A hụrụ m gị n'anya ụbọchị niile."" Akwụkwọ Weber ji jụọ Antoine 'ị ga-alụ m' Ọyị ya nwaanyị dere na Facebook ya na ihe ọkara ịza ajụjụ ị ga-alụ m ọyị ya nwoke kara ị bụ ""eeh...nde kwuru nde."" Antoine kwuru na ihe na-akasị ya obi bụ na ha abụọ nọkọrọ tupu ọ nwụọ. Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ US na-ahụ maka ọnọdụ ndị be ha n'ofesi ekwuola na ha ma maka ya bụ ọnwụ ma na-eti ezinụlọ Weber aka n'obi. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị Idu Okwuosa" 43222496,https://www.bbc.com/igbo/43222496,Ntọrọ Dapchi: Kọmitii etinyela anya maka ụmụakwụkwọ a tọọrọ,Gọọmentị etiti ahọpụtala mmadụ iri na abụọ ga-achọpụta ihe gbasara ụmụakwụkwọ 110 atọrọla n'obodo Dapchi n'izu gara aga.,"Dika Chibok, onweghị onye ma ebe ụmụakwụkwọ ndị a nọ Minista ọrụ mgbasa ozi bụ Lai Mohammed depụtara akwụkwọ gosiri na ọ bụ Babagana Monguno bụ onye ndụmọdụ gbasara nchekwa Naịjirịa kpọkọrọ kọmitii a. N'akwụkwọ ozi ha zipuru ndị ntaakụkọ, kọmitii nke a ga-enyocha ọnọdụ ndị ji egbe tọrọ ụmụakwụkwọ a, ma tinyekwa anya na ndị agha chere nche na Dapchi oge mpkamkpa a mere. Ihe kachasị mkpa bụ ị leba anya n'etu ha ga-esi zọpụta ụmụakwụkwọ a. Kọmitii nke a ga-ede akwụkwọ nchọpụta ha nke mbu n'ubọchị 15 nke ọnwa Maachị n'afọ 2018. Ndị ga-eso n'otu a bụ ndị agha ala, agha mmiri, agha elu, ndị uweojii, DSS bụ otu ndị na-echekwa na nzuzo na otu dị icheiche ndị ọzọ. Mana ihe a mere na Dapchi nwere ike itinye ụjọ n'ahụ ọtụtụ nne na nna gbasara iziga ụmụ ha akwụkwọ dịka senatọ Ben Bruce kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51400945,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400945,Donald Trump: Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa,"Na nyocha ngalaba ""Pew Research Center"" (PRC) mere nke BBC jiri dee akụkọ n'ọnwa Jenụwarị 2020 , Naịjirịa pụtara dịka nke anọ n'ime mba ndị kachasị hụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump n'anya.","Ịhụnanya a, n'agbanyeghị na ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya, pụtakwara n'ihe dịka atụmatụ ichutu Trump na-enwu ọku n'Amerịka. Ka Trump mechara nweta mkpebi ọ ga-eji wee ka nọrọ n'ọkwa dịka onyeisiala Amerịka, ndị mmadụ na Naịjirịa pụtakwara n'igwe na-enwe aṅụrị maka ya. Alexander Otti, otu onye a ma dịka onye na-akwado Trump ọfụma na Facebook sị na mmeri Trump bụ mmeri banyere ndị ọ kpọrọ ""Swamp"". Okwu Otti bụ ihe ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị si ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-ekwu. Tchidi Chimezim sọkwa n'otu aka ahụ enwe aṅụrị maka mmeri Trump meriri. Ọnụ okwu bụ ihe anaghị achọ achọ na soshal midia nke Naịjirịa; maọbụ na Twitter, Facebook na WhatsApp. Mana, ajụjụ so ya wee bụrụ, ọ ginị mere o jiri dị etu a? Ọkachasi ma e tinye anya n'etu ọtụtụ ndị mmadụ na-ede ma na-ekwu na Trump bụ onye na-akpa oke agbụrụ nke ukwu. 'Trump bụ onye ụka' Ọtụtụ ndi isi ụka na Amerịka na-akwado Trump Ide Ben Bennet Udeogu, bụ onye ihe Trump na-amasị nke ukwu bi n'Ugwu Awụsa gwara BBC Igbo na ihe mere ndị si Ọwụwa Anyanwụ ji na-akwado Trump abughị ihe kwesịrị ị na-agbagwoju ndị mmadụ anya. Ide Udeogu sị: ""Ọtụtụ ndị agbụrụ anyị bụ ndị na-eso ofufe Kraịst. Trump na onwe ya bụ onye na-ekwu na ọ ga na-agba mbọ ịhụ maka ọdịmma ndị ofufe Kraịst."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na Trump egosila na ọ ga-emezu nkwa o kwere. ""Leenu etu Trump siri gwa Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọ gara njem n'Amerịka na ya agaghi anọ hụ na emekpara ndị ofufe Kraịst ahụ na Naịjirịa."" Ide Udeogu, n'ịsa ajụjụ maka mmachi Trump machiri ndị Naịjirịa ịbata Amerịka ịbịa obibi, sị na ọ bụghị Trump ka nke a dị n'aka. ""Ọ bụ ọnọdụ Naịjirịa nọ butere atụmatụ ahụ."" Mana onye ọzọ bụ nwaafọ Naịjirịa bi na Nọt Karolịna dị n'Amerịka bụ Kommanda Ezu ekweghi na Trump bụ onye ụka. Ọ masịghi ụfọdụ ndị na-akwado Trump na Naịjirịa oge o zutere Onyeisiala Buhari n'Amerịka ""I nnyochaa etu ndị uka si akpa agwa, ị hụ na Trump abụghịdị ya ma ncha."" N'agbanyeghi nke a, ọ sị na ọ ga-amalite ikwado Trump. ""Ọ bụ Hillary Clinton ka m tụnyeere vootu n'afọ 2016. Mana ugbua, ọ bụ Trump ka m ga-atụnyere."" Maazị Ezu sị na ihe kpatara nke a bụ na Trump na-emezu ihe o kwuru. ""Ihe niile Trump kwuru na ọ ga-eme tupu ọ rigoo n'ọkwa ka ọ na-eme ugbua."" Maazị Ezu sịkwa na n'agbanyeghi na o kwenyere na Trump so na-akpata oke agbụrụ n'Amerịka, ọ ga-atụrụ ya maka na ""o nweghi onye ga-emerinwu ya n'ogige ndị Demokrat"". Maka mmachi ndị Naịjirịa, ọ sị na ndị ọ dị n'aka bụ ndị na-achị Naịjirịa. ""Ọ bụ Naịjirịa ka Trump sị ndị Naịjirịa ghara ịbata? Ọ kwa Amerịka? Ọ bụrụ na Naịjirịa dị mma, dị mmadụ a ga-achọ ịkwaga Amerịka?"" 'Trump kwenyere na Biafra' Ihe ọzọ na-eme ka ọtụtụ ndị ọwụwa anyanwụ jiri na-akwado Trump bụ okwu Biafra. Ndị na-akwado Biafra na-apụtakarị na soshal midia etinye foto Trump maọbụ ihe onyonyo ya. Oge Trump meriri na 2016, ndị na-akwado Trump mekwara ngagharị ọṅụ na Pọt Hakọt. Ide Udeogu rụtụkwara aka na nke a mgbe o kwuru maka njem onyeisi otu na-acho Biafra bụ Nnamdi Kanu gara n'Amerịka. ""Trump kwenyere n'ihe ndị na-achọ Biafra na-eme. Ọ bu ihe mere o jiri kpọọ Nnamdị Kanu ka ọ bịa ebe ọ na-achụ nta vootu ka ọ hụ etu ihe si aga."" Nke bụ eziokwu bụ na ndị mmadu ka ga na-akwado Trump na mpaghara a, n'agbanyeghi na o nweghi ihe ọbụla gosiri na Trump ma maka ha maọbụ kwenyere na ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53753689,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53753689,Risikat Azeez: Ihe na-akpata mkpụrụ anya mmadụ ji acha anụnụ anụnụ,Na nsonso a ka akụkọ pụtara gbasara otu nwaanyị aha ya bụ Risikat Azeez onye di ya chụpụrụ n'ụlọ n'ihi na mkpụrụ anya ya na nke ụmụ ya abụọ na-acha anụnụ anụnụ (blue).,"Ọtụtụ ndị mmadụ malitere inyere Risikat Azeezat na ụmụ ya aka dịka akụkọ kwuru na di ya chụpụrụ ha n'ihi ụcha anya ha. Mana ngwangwa akụkọ ahụ pụtara na soshal midia, ọtụtụ ndị mmadụ malitere inye nwaanyị ahụ na ụmụ ya ihe onyinye pụrụ iche iji nyere ha aka. Ya bụ ihe tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya n'ihi na anaghị ahụ ya bụ ihe kwadaa. Mana gịnị na-akpata ụdị ọnọdụ a? Ihe nwere ike ime ka anya mmadụ na-acha anụnụ anụnụ Risikat Azeezat na ụmụ ya Dọkịta Chinedu Njezi bụ onyeisi ụlọọgwụ anya a kpọrọ Sight Haven. Ọ kọwara na Risikat Azeez nwere ike inwe ọnọdụ anyarị anya nke bekee na-akpọ 'occular albinism'. 'Occular albinism' bụ ọnọdụ mgbe 'melanin' kọrọ ụkọ n'anya mmadụ. 'Melanin' bụ ihe na-eme ka ahụ mmadụ nakwa mkpụrụ anya ya gbajie oji. Ọbụkwa 'melanin' na-echekwa akpụkpọ ahụ nakwa mkpụrụ anya mmadụ ka anyanwụ ghara imebi ya. Dịka dọkịta Njezi si kọwaa, ndị bụ anyarị (albino) anaghị enwe 'melanin' n'ahụ ha, ọtụtụ n'ime ha anaghịkwa enwe ya na mkpụrụ anya ha. Njezi kwuru sị: ""N'ime ndị anyarị mmadụ iri, asatọ ga-enwe 'occular albinism, mana n'ime ndị ojii otu puku, naanị otu ka e nwere ike ịhụ 'ọccụlar albinism' n'anya ya"". Ọ gara n'ihu kọwaa na ya bụ ọnọdụ abụghị nke naanị nne maọbụ naanị nna na-ebufere nwa; ọ ga-esiriri n'aka ha abụọ. Na nkọwa ya, ọtụtụ n'ime anyị nwere anyarị n'ime ahụ anyị, mana ọ pụtaghị ihe; Bekee na-akpọ nke a 'recessive gene'. Ọ bụrụ na onye nke ya pụtara ihe nke ọma gakwuru onye ọzọ nke ya apụtachaghị ihe, ha abụọ nwere ike ịmụta ụmụ anya ha ga na-acha anụnụ anụnụ dịka Risikat Azeez na ụmụ ya. 'Occular Albinism' ọ bụ ọrịa? Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ 'Occular Albinism', dịka dọkịta Njezi si kọwaa, abụghị ọrịa kama ọ bụ ọnọdụ. Obere ihe nhiahụ ndị nwere ya ga na-agabiga bụ na ọkụ ga na-enyekarị ha nsogbu n'anya. Njezi kwuru sị: ""Ihe izizi a ga-eme bụ inye ha ugogbo anya na-egbochi anwụ ịba mmadụ anya, nke Bekee kpọrọ 'sun shades'. O kwukwara na ọ bụghị ndị niile nwere ọnọdụ a ka ọ na-enye nsogbu. Gịnị ọzọ nwere ike ime ka ụcha mkpụrụ anya mmadụ gbanwee? Nwaada Diakité bụ nwa Ivory Coast nwere 'Heterochromia irides' Ọnọdụ ọzọ nwere ike ịkpata ụdị ihe a bụ nke dọkịta Njezi kpọrọ 'Heterochromia irides'. Mana nke a bụ mgbe mkpụrụ anya abụọ nwere ụcha dị iche iche, otu nwere ike na-eji oji, nke ọzọ na-acha anụnụ anụnụ." afirika-49872693,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49872693,Enugu Airport: A rụchala ọdọụgbọelu Akanu Ibiam,"Minister na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na ụbọchị 30 nke ọnwa Ọgọstụ ka a ga-emepa Akanu Ibiam Int'l Airport, Enugwu a lụgharịrị ọhụrụ.","Sirika kwuru nke a oge ọ bịara njem nleta ka ọrụ si aga na ya bụ ebe. Cheta na ọ bụ ihe dịka ọnwa asatọ gara aga ka a malịtere ọrụ n'ọdọụgbọelu ahụ. O kwukwara na na otu nwoke aha ya bụ JJ Emejulu ga-enweta ntaramahụhụ gọọmenti n'ihi na o gara kutuo ngwuru gọọmenti, ebe ha dobere maka ịrụ 'Free Trade zone' n'akụkụ ọdọụgbọelu ahụ. Emejulu kwuru na gọmenti naara ya na ọtụtụ mmadụ ala ha ma kutuo ụlọ ndị mmadụ na enweghi ego iti aka n'obi ọbụla. Mazi Hadi Sirika gọmenti etiti adịla njikere ịdọnyere gọmenti Enugwu ukwu iji kpochapụ ihe ọbụla ga abụ ọgbatauhie na ọrụ airport ahụ. Sirika na onye ọnọchite anya gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gagharịrị gburu gburu Akanụ Ibiam Int'l Airport Enugwu. Ọrụ amalitebeghi n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu Otu n'ime ndịisi na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu a kpọrọ 'Federal Airport Authority of Nigeria' gbaara BBC Igbo izu nke a n'ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Septemba. Mana o kwuru ka a ghara ịkpọ aha ya n'ihi na enyeghị ya ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu. BBC kpọtụrụ onye a n'ihi akụkọ ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche dere na-ekwu na ọrụ a malitela na ọdọụgbọelu ahụ. Ma ọ gwara anyị na ngalaba Faan emechaala nchọpụta na nkwado niile ha ga-eme gbasara ọrụ ahụ. N'okwu ya: ""Nke fọrọ afọ ugbua dịịrị mịnịstrị nke okwu njem ụgbọelu dị n'aka a kpọrọ 'Ministry of Aviation'. Mịnịsta na-elekọta ya bụ ngalaba bụ Hadi Sirika. Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru na ya na onyeisiala Muhammadu Buhari kpara maka ọdọụgbọelu Enugwu mgbe ha nwere nzuko. Cheta na gọọmentị etiti mechiri ọdọụgbọelu Enugwu n'ọnwa gara aga iji wee ruzie ụzọ ya. Mana kamgbe ahụ ọrụ amalitebeghị na ya bụ ebe. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ajụ mgbe ọrụ ga-ebo na ya bụ ọdọụgbọelu. Ndị gọvanọ ala Igbo tinyere ọnụ n'okwu ahụ wee gwa ndị mmadụ ha akụjala akụja maka na a ga-emepe ya bụ ọdọụgbọelu tupu emume ekeresimesi eruo. Onyeisi otu jịkọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi kwuru na ya na onyeisiala Buharị kpara maka ọdọụgbọelu ahụ mgbe ha nwere nzukọ n'ọdịnso a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu" afirika-48559489,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48559489,School building fire: Ọkụ agbagbuola ụmụaka ruru 26,Ọkụ bidoro n'ụlọobibi ụmụakwụkwọ agbagbuola o pekata mpe ụmụaka ruru 26 n' isi obodo Liberia bụ Monrovia.,"Igwe mmadụ gbakọrọ na nso ebe ọdachị ahụ mere Ụmụaka ndị a dị agbata afọ iri na afọ iri abụọ na-arahụ ụra n'ụlọ dị nso n'ụlọụka Alakụba oge ọkụ ahụ bidoro n'ụzọ ụtụtụ taa bụ Wenezde. Ndị uweojii mba ahụ gwara BBC na a ka na-achọ ozu ndị nwụrụ anwụ. Naanị otu onye nkuzi nakwa ụmụakwụkwọ abụọ bụ ndị zọtara isi onwe ha n'ọdachị ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Moses Carter gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters na ọ bụ nsogbu metụtara ọkụ latrik butere ọdachi ahụ mana na ha na-aga n'ihu na nnyocha ha. Ka ọ dị ugbua, onyeisiala mba Liberia bụ George Weah ezipụrụla ezinaụlọ ọdachi ahụ metụtara ozi iti aka n'obi n'akara Twitter ya. O kwuru sị na ""ekpere m na-agara ezinaụlọ ụmụaka nwụrụ oge ụlọakwụkwọ gbara ọkụ n'abalị n'obodo Paynesville."" Onye ntaakụkọ BBC bụ Jonathan Paye-Layleh, onye nọ si ebe ihe mere zite akụkọ kwuru na ụgbọ na-ebu ozu nke otu 'Red Cross abịala bupụ ozu ndị a. A na-elekwa anya ili ozu ụmụaka ndị ahụ n'ehihie taa bụ Wenezde. Akụkọ ka na-abịa." afirika-43375002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43375002,'Anyị na-enyocha onye nwe ngwa agha a'- Kọstọm,Joseph Attah bụ onye na-ekwuchitere ndị Kọstọm sị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ha jichiri n'ọdọ ụgbọ mmiri Lagos.,"Ọdọ ụgbọmmiri Lagos ebe ejichiri ngwa agha a Ọ gwara BBC n'elu ekwentị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ma sị ya jee weta akwụkwọ dị mkpa akpọrọ 'End-User Certificate.' Ha nyere ya ụbọchị ịrị atọ iji weta akwụkwọ ahụ n'aka ụlọọrụ na ahụ maka nchekwa n'ala niile bụ 'National Security Adviser' n'olu bekee tupu enyeghachi ya ngwa ya. Ka BBC gbara ya ajụjụọnụ, Attah kwuru n'onwebeghị ihe gosiri na ọ bụ gọọmnetị Kogi steeti tụbatara ahịa ahụ ka onye ọrụ sineti Dino Melaye si kwuo. Mgbọ n'ọtụtụ ngwa ndị agha so n'ihe ejichiri Ihe butere okwu a bụ ebubo Sinatọ Dino Melaye boro onye na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello bụ ya bubatara ngwa agha ahụ. Ọ sị na otu onye enyemaka Bello maka ihe gbasara nchekwa bụ Jerry Omadara gara n'ụlọọrụ ndị Kọstọm mgbe ọ pụtara ihe na ha jichiri ngwa agha ahụ were gwa ha na ọ bụ ndị Kogi nwe ngwa agha ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44439398,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44439398,#EndSARS: Mgbanwe ọ bịala na ngalaba uweojii a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ?,"Ndị Naịjirịa amalitela ịchọ ka amachịe ngalaba uweojii akpọrọ SARS n'ịchafụ site na atụmatụ akpọrọ #EndSARS na soshal midia, ọkachasị Twitter.","Ndị uweojii Naịjirịa Cheta na n'ime afọ gara aga ndị mmadụ na soshal midia malitere atụmatụ #EndSARS a ka ọtụtụ mmadụ bidoro ide ihe ha na-ahụ n'aka ndị SARS, ọkachasị etu ha si awakpo ha ma napụ ha ego n'ike. Mgbe ahụ, akara #EndSARS wuru ewu ọfụma, nke mere ndị uweojii jiri tinye ọnụ na ya bụ ihe na-ese okwu ma kwuo na ha ga-ahazịgharị SARS. Mana, ka ndị mmadu na-ekwu na soshal midia, nakwa site n'ihe na-emegasị, ụfọdụ ndị SARS ka na-aga n'ihu na-emekpa umu Naịjirịa ahụ. N'ọnwa Maach nke afọ a, Immanuel James Ibe-Anyanwu tiri mkpu na Facebook na ndị SARS chebiri ya ka osi ụlọaku apụta were chọ iwakpo ya. Mkpu a otiri mere ka ndi mmadụ, ma onye bu ọnụ na ekwuchitere uweojii na Legọs, gbatara ya ọsọ nyemaka. Ndị uweojii mechakwara jide ndị kpara ike a. Gee etu o siri kọwa njem ya ebe a: Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya. Ka a ka na-ahụ asọ Ibe-Anyanwu gbụrụ n'ala anya, onye ọzọ tikwara udiri mkpu ahụ na Twitter. Nwaada Ifeoluwa Adegoke, bụ onye ji akara @ife_luv12 na Twitter dere na otu onye uweojii wakporo ya ma yie ya egwu, n'ihi na ọ jụrụ inye ya ego n'agbanyeghị na onye uweojii ahụ kwuru na ọ gaghị ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyeghị ya ego. Mkpụ a na soshal midia mere ka anwụchịkọ onye uweojii kpara ike a. Mana, agbanyeghi na ndị mmadu dị ka Ibe-Anyanwu na Ifeoluwa Adegoke jizi soshal midia na-eti mkpu na-eme ka ejide ndị aka ha dị na arụ a, akụkọ ndị akpasiri ụdịrị agwa ka na-apụtakwa. Ngalaba anọghi na gọọmentị na-ahụ maka mmekpa ahụ bụ nke akpọrọ Amnesty International n'asụsụ Bekee dere na nchọpụta ha mere gosiri na ndị SARS na-enufuru iwu obodo isi ma na-awakpo ụmụ Naịjirịa. Ha gakwara n'ihu dee na ndị uweojii na-ahụ ikete ọrụ na ngalaba SARS ka ohere iji bụrụ ogalanya, nke mere otu onye n'ime ha jiri kwuo na ha na-akwụ ihe ruru puku naira 300 iji nye aka azụ ka ha nweta ọrụ a. Ka amalitere #EndSARS ọzọ, ihe ndị mmadụ na ajụ bụ ma mkpu nke ugbua ọ ga-eme ka ndị nwere ikike ịhazị ngalaba uweojii a ha a ga-eme ihe ndị a na-akwado atụmatu a chọrọ? Na mkparịtaụka BBC Igbo mere banyere okwu a na Facebook n'ime izuụka ato gara aga, nwaafọ Igbo bụ ọnu na ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti kwuru na ọrụ ndị uweojii bụ ichekwa ndị mmadụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bu eziokwu na o nwere ndị uweojii na-akpa arụ, mana ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime ha. Na ọzọ, o kwukwara na ndị ọrụ uweojii ruru mmadụ puku 400, nke mere mmadụ agaghi ịsị na ndi na-eme mpụ anọghị n'ime ha, ma a na-achụ ha ma achọpụta ihe ha mere. Oti gakwara n'ihu were si na ọ ka onye uweojii mma na ọ yipụrụ uwe ya wee kpawa ike, makana ọ bụru na onye uweojii kote okwu, o kaara ya mma na-amụghị ya amụ. Mana, okwu ya ka koro n'elu makana ihe na-ebe ka na-ebe. #EndSARS ka na-ewukwa na Twitter ka anyị na-ede akụkọ a. Akụkọ ga-amasi gị:" afirika-49148651,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49148651,Whale Ashore: Ndị obodo Brass na Bayelsa abanyela oriri,Ndị mmadụ bi na okpuru ọchichị Brass dị na Bayelsa steeti na aṅuri ọnụ dịka ha hụrụ anumanu a na-akpọ 'Whale' na Bekee n'oke oshimiri ha.,"Berebofe Ebi-Johnson bu nwaafọ Opkoama gwara BBC na nkea bụ ugboro atọ udiri ihe na eme n'oke oshimiri ha. O kwuru na ọ bụ n'afo 1983 na 1984 ka ha hụrụ ụdịri ihe a tupu nke a e mee kama ha amaghị ma anụ a a dị ndụ ka ọ nwụrụ anwụ. Ka o si di ugbua, ha ka na eke anụ a kemgbe sundei ihe a mere. Ọgbaaghara dapụtara n'ụlọnga Brazil ataala isi mmadụ iri ise Mkpmkpa a bidoro dịka otu ọjọọ hapụrụ ebe ha bi na ya bụ nga were nwakpo ndị bị ebe ọzọ nke mere ka ọgụ bido. N'ime mmadụ 50 nwụrụ, mmadụ iri na isii bụ ndị ebepụrụ isi na ogbaaghara a. Ndị ụlọmkpọrọ a weputara akwụkwọ maka ihe mere na-akọwa na amụnyere ọkụ na ụlọnga ahụ nke mere ka aṅụrụọkụ gbuo ụfọdụ ndị. Henry Onyekuru ebidola njem n'otu bọọlụ Galatasaray Ndị otu bọọlụ Galatasaray ebidola ije íbitekwa Henry Onyekuru n'aka Everton maka afọ ọhụrụ. Cheta na Onyekuru enyela Galatasaray aka maburu iko n'asọmpị abụọ otu ahụ gbara n'ala Turkey mbụ. Lekwa Chimamanda Adichie n'ihu Vogue! Ada Igbo bụ Chimamanda Adichie esorola na umunwanyi ndị na egbuke ka kpakpando n'ihu akwụkwọozi Vogue. Akwụkwọozi nkea kacha puọ iche n'ihi na ọ bụ Meghan Windsor onye bụ ""Duchess of Sussex"" bipụtara ya. Meghan bipụtara akwụkwọozi nke a iji were gosipụta ụmụnwanyị kwaturu ihe mgbochi dị icheiche. Akwụkwọ mmachị ahụ bụ adigboroja Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha N'aka nke ozo ka Uloma Rochas Nwosu na etisi mkpu ike na akwụkwọ ha ji wakpo ụlọ ya bụ adigboroja. Onyeisi ngalaba na-ahu maka inakọta ego niile ezurufuru ndị gọọmentị Imo steeti bụ Jasper Ndubuaku ekwuola na ha natara akwukwọ ikike ha na Magistrate Court nke Anambra steeti. Ndị mmadụ nwụrụ na mwakpo ndị Boko Haram wakporo otu obodo na Maiduguri arịala ruo mmadụ iri isii na ise. Muhammed Bulama bụ onyeisi okpuruọchịchị ebe ya bu ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ iri abụọ na atọ ka Boko Haram gburu mgbe ha sị ụlọakwa alọta, ebe mmadụ iri anọ na abụọ nwụrụ mgbe hachụwara ndị Boko Haram ọsọ. Nwada Igbo bụ ọkaibe n'ule WAEC 2019 Ugboaja Chizobam Stephanie dị afọ iri na isii abụrụla ọkaibe dịka ewepụtachara mpụtara ule ""West African Examination Council WAEC) nke 2019. Ugboaja bụ onye Imo steeti gụrụ akwụkwọ na Port Harcourt nwere A1 na sọbjekt ruru itolu o lere na WAEC. Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na otu onye Naịjirịa nọ na mba ofesi enyela ya ohere ka ọ bịa gụọ akwụkwọ n'efu na mahadum dị na mba ofesi. Egbe agbara n'emume oriri na nkwarị e mere na California Ndị ọrụ gbata gbata gbatara n'ebe ahụ ozugbo ozugbo Mmadụ atọ anwụpịala ebe mmadụ iri na ise merụrụ ahụ ka o ji egbe egbu gbapụrụ egbe n'emume nri n'obodo California dị na mba US. Ndị uweojii gbaturu oji egbe egbu ahụ ka otechaghị aka o bidoro gbapụwa egbe. Mmemme ahụ akpọrọ ""Gilroy Garlic"" na-abịa na njedebe mgbe nwoke ahụ bidoro gbawa egbe ebe ahụ. Nkata ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-akpa Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Otu jikotara ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ekwekọritala ihibe ngalaba ga na-elekọta ihe gbasara nchekwa na mpaghara ahụ niile. Nke a bụ otu n'ime ihe ha kpebiri n'ọgbakọ mbụ ka mgbe ha weghara ọchịchị ha nwere n'Enugwu unyaahụ, ebe ha nọkwara kwuo hoo haa na ha enweghị ala ha ga-enye gọọmentị etiti maka RUGA. Eze pụọ, eze anọchie n'Amerịka Dan Coats na Trump na-enwekarị esemokwu gbasara Iran, North Korea, na Russia Na mba ofesi, onyeisi na-elekọta ụlọọrụ nnyopu na nchekwa na mba Amerịka bụ Dan Coats agbaala arụkwaghị m. Onyeisiala Donald Trump ahọpụtalarị onye ọzọ aha ya bụ John Ratclifee dịka onye ga-anọchị anya ya. N'egwuregwu, Nwatakịrị nwanyị onye Amerịka aha ya bụ Coco Gauff etozuola isonye na asọmpi Washington Open mgbe o meriri Hiroka Kuwata nke mba Japan ụnyaahụ. Gauff onye gbara naanị afọ iri na ise pụtara ihe n'asọmpi Wimbledon nke e mere n'ọnwa gara aga ebe ọ nọrọ merie onye tennis a ma ama bụ Venus Williams. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Etu esi ahazi Ji Kpacha" afirika-47275942,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47275942,INEC: Ndị ndọrọndọrọ nwereike ịmalite achụmnta vootu ọzọ,Ọ bụ n'akara Twitter ha ka ha siri zipụ ya bụ ozi kwuru na ndị otu ndorondoro dị icheiche nwereike ị malite achụmnta vootu ọzọ,"Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015 End of Twitter post, 1 Ha kwukwara na ọ ga-ebi n'etiti abalai ụbọchị 21 nke ọnwa Febụwarị. Cheta na Inec machiburu achụmnta vootu mgbe mbụ ha dọtịrị ụbọchị ntuliaka site na ụbọchị 16 rue n'ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị. O nwebeghi ihe ha kwuru maka ị hazi ohere ka ndị mmadụ bido ị nata PVC ha ọzọ. Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na onye ọbụla napụrụ igbe vootu maọbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ji ndị agboro kpaa ike n'oge ntuliaka na-abịa ga-atunye ndụ ya. Mana ụfọdụ ndị mmadụ akatọọla okwu a na-ekwu na ọ dị ka Buhari a na-akwado ogbugbu mmadụ. Gụọ ya n'uju ebe a: APC Caucus meeting: Nyụọnụ onye ọbụla ga-anapụ igbe vootu n'ike ịkpakwụ - Buhari Ọzọ, 'Onye ọrụ kọstọm gbagburu mmadụ kwesịrị ị ga mkpọrọ' Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nchekwa akpọọla oku ka atụnye nwoke onye Customs gburu mmadu ụlọ mkpọrọ. Kelechi Eze onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere kọwara na o nweghi ikike ịgbu mmadụ ma ọ buru godi na onye ahụ mere ihe ọjọọ kama ọ nwụchie ya. Na mba ofesi, Gọọmentị mba Gana anwụchiela mmadụ karịrị otu narị na atụmatụ ọhụrụ ha bidoro iji chọpụta ndị mbịara mbịara enweghi akwụkwọ na bee ha. E chere na ọtụtụ ndị mmadụ n'ime ndị a anwụchiri bụ ndị si mba Naịjirịa bịa. N'egwuregwu, Taa ka a ga-ama mbe na-abọ nke bụ oke n'etiti Chelsea na Man United dịka ha na-akwado izute onwe ha n'asọmpị FA Cup. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Inec na-agha ụgha-Mịnịsta ụgbọelu Hadi Sirika Mịnịsta nta na-ahụ maka njem ugbọelu bụ Senatọ Hadi Sirika ekwuola na ọ bụ ụgha na ihu igwe adịghị mma ife ụgbọelu n'abalị fotere ụbọchị Satode a gara ime ntuliaka. Onyeisi Inec bụ Mahood Yakubu kwuru ụbọchị Satode na ọ bụ n'ihi na ihu igwe adịghị mma mere ka ha ghara ifega akọrọngwa e ji-eme ntuliaka ebe di iche iche o kwesiri maka ntuliaka kara ime na Satọde gara aga. Sirika kwuru nke a n'igwe okwu Twitter ya. APC na PDP sị na ha ga-amalite ntuliaka ọzọ Ndị otu pati APC na PDP esiela ọnwụ na ha ga-amalitekwa ọzọ ọsọ achụmta vootu ha dịka Inec higharịrị ntuliaka rue izu ọzọ. Inec kwụsịburu ọsọ achụmta vootu awa iri abụọ na anọ tupu ntuliaka a kara ime na Satọde gara aga. Mana PDP kwuru na ha ga-ebidokwa ọsọ achụmta vootu ha n'ihi dịka iwu ntuliaka Naijiria kwuru na 'Achụmta vootu ga-ebido abali 90 tupu ntuliaka ma kwụsị awa iri abụọ na anọ tupu ụbọchị ntuliaka."" Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha YPP bụ Kingsley Moghalu kpọkwara oku ka Inec nye ohere ka ebidokwa mgbasaozi ntuliaka rue abalị abụọ tupu ntuliaka. Ndigbo cherenụ tuo vootu Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Ohanaeze Ndigbo arịrọlaNdigbo lọtara maka ntuliaka ka ha do do do, nwe ndịdị tụọ vootu tupu ha lọhachi ebe ha siri bịa. Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo onye kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o zigara ndị ntaakụkọ kwuru na ịta ahụhụ otu izu ka mma karịa ahụhụ afọ anọ ọzọ. Osaka ekwuola ihe mere na onye nchịkọta ji gbasaa N'egwuregwu, Onye ọkachaibe na bọọlụ tenis na mbaụwa bụ Naomi Osaka ekwuola na ya agaghị emegbute onwe ya iji mekwata onye ọzọ dịka ya na onye nchịkọta ya gbasara abalị iri na isis o jiri mericha na asọmpi Australia Open." afirika-50970142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970142,2020 Prophecies: Ihe PDP sara Mbaka gbasara amụma 2020,"""Mbaka ọ bụ ọkaikpe? Mbaka ọ bụ 'Supreme Court'? Ọ bụ sọ Mbaka bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu?""","Nke a bụ ajụjụ Damian Opara bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' nke Imo steeti na-ajụ. Opara jụrụ ajụjụ a gbasara amụma afọ ọhụrụ nke Mbaka buru. N'amụma ahụ, Mbaka kwuru na Hope Uzodimma ga-eweghara ọchịchị n'aka gọvanọ Emeka Ihedioha n'oge adịghị anya. Mbaka kwuru na ọ bụ Uzodimma bụ olileanya ndị Imo steeti. Hope Uzodinma ji aha APC zọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 Cheta na Uzodimma so wee zọọ ọkwa gọvanọ ime n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mana ọ dara. O mechara buru okwu ahụ gaa ụlọikpe ma dakwaa ọzọ. 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka Na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo n'ụbọchị Tọzde, Opara kwuru na amụma ahụ Mbaka buru enweghị isi. O kwuru sị: ""O doro anya na Mbaka bụ onye otu APC."" ""Ọ kwụnyere Buhari megide ndị Igbo na ntuliaka niile e merela."" ""Mana amụma ya abụghị eziokwu n'ihi na ụlọikpe 'Supreme Court' ekpebiela ikpe ahụ. Imo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri ' Opara kwuru na ndị PDP nakwa ndị Imo steeti niile kwụ Gọvanọ Ihedioha n'azụ. O kwukwara na amụma Mbaka anaghị echu ha ụra n'ihi na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu. Amụma Mbaka buru maka afọ 2019 Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ekeresimesi oge ọchịchị Rochas ọ ka nke Ihedioha mma?" afirika-44546993,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44546993,Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ Bọjeti 2018,"Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ Bọjeti 2018, ọnwa isii e jiri bunyecha ya ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ahụ.","Onyeisiala Buhari nyere ndị ụlọomeiwu etiiti Bojeti ọnwa isii gara aga Onyeisiala onye kwupụtara na ya ebinyela aka ya n'akwụkwọ bọjeti afọ na igwe okwu Twitter ya. End of Twitter post, 1 Cheta na ụlọomeiwu nke etiti manyekwuru N500bn na N8.612tn bu egọ bọjeti afọ 2018 nke onyeisiala nyere ha ka ha lebanye anya nke mere ka bọjeti gbalie rue N9.120tn. Buharị tụrụ arịrị maka mgbanwe ndị ụlọọimeiwu mere n'akwụkwọ bọjeti ahụ ma kwuo na ọ bụ iji ghara ịga n'ihu na ịkpụ ụkwụ dịka o si gbasa nhazighari akụnaụba Naijiria nke na akpụ n'ala mere ya jiri mechie anya ma tinye aka n'akwụkwọ ahụ. Mgbanwe ndị ụlọomeiwu mere dịka Buhari siri kọwa gụnyere iwepụ ego ruru ijeri N347 bụ ego a mapụtara maka ọrụ dị 4,700 ma tinye ọrụ nke onwe ha dị 6403 nke ego ya ruru ijeri N578. Onyeisiala kwuru na ya ga-agba mbọ ihazigharị ihe gbajọrọ na Bojetị site na ime Bọjeti mgbakwụnye(supplementary budget). Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44245095,https://www.bbc.com/igbo/44245095,Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Trump na Kim Jong-un agahizi enwe nzụkọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ na-eme alụkwaghịm Abụbọ ọrụ ndị ọrụ ahụike ka na-aga n'ihu ebe ha na-aga n'ụlọọgwụ ịhụ na ndị otu ha na-esonyekwa. Naịjirịa Jega ga-ekwu okwu gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya ụbọchị mmemme ncheta ya. Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ INEC ma bụrụkwa onye mere ntuliaka 2015 bụ Atahiru Jega ga-ekwu okwu ụbọchị ncheta mbido ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa. Ụlọọrụ mgbasaozi gọọmenti etiti kwuru na Jega ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a ga-eme maka ya bụ mmemme ụbọchị Mee 29. Akụkọ mba ofesi Ọgbakọ Trump na Kim Jong-un akpụọla afọ n'ala Ọgbakọ ụwa niile na-ele anya na Amerịka na Nọt Koria ga-eme agaghizi eme Nke a bụ maka na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọgbakọ ahụ agaghị eme maka iwe na ajọ agwa ndị Nọt Koriya kpasoro ha. Nke a niile na-eme dịka ndị Nọta koriya mebiri ebe ha na-emepụta ngwọagha nuklia taa. Nọt Koriya nabatara ọtụtụ ndị ntaakụkọ si mba Briten, China, Russia, Sawụtụ Koriya na US ịbịa hụ ka ndị ọrụ ha na-emebi ma na-emechi ebe ha si emepụta ngwọagha ahụ. N'egwuregwu, Andres Iniesta bụ onye si Barcelona pụọ na ngwụcha afọ a etinyela isi na Japan dịka o tinyela aka n'akwụkwọ ndị otu egwuregwu Vissel Kobe nke mba ahụ. ọ zaghị oku ndị otu egwu bọọlụ ndị ọzọ kpọrọ ya kamgbe ọ hapụrụ Barcelona. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ihe mere m jiri wuo n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan." afirika-50866217,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50866217,Naira Marley: Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ Sekem,"Sịte na ndọrọndọrọ ọchichi ma rụọ na ndị na-eti egwu, izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ.","Ka anyị bido na ihe gbasara ụlọụka COZA na otiegwu Davido, Wizkid na Tiwa Savage. 1) COZA na ndị otiegwu Ihe so wụo ewu n'ịzu a bu akụkọ na-ekwu na ndị ụka COZA jị ụzọ aghụghọ tinye ndị otiegwu ama ama bụ Wizkid, Davido na Tiwa Savage n'ihe ejiji ha ji akwado emume ụka ha chọrọ ime. Mgbe ndị otiegwu a chọpụtara aghụghọ a, ha were iwe ma gosipụta ya na ihe ha depụtara na Soshal Midia ha . Lee ihe ejiji nke eji Davido mee. End of Twitter post, 1 Lee ihe ejiji nke eji Wizkid na Tiwa Savage mee Lee etu ha si gosipụta iwe ha Tiwa Savage Wizkid Davido Ka ọ dị ugbu a, ndị COZA ewepụla ihe ejiji a ha mere, kama onweghị ihe ha kwurula maka ya. 2) Donald Trump Trump ka bụ kwa Onyeisiala Amerịka dịka ọ na-eche ka ndị ụlọomeiwu ukwu kpebie Ndị ụlọomeiwu nke mba Amerịka emeela atụmatụ 'impeachment' nke kwuru na Trump emetela ihe ekwesiri iji chụọ ya dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. 3) Sotitobire Church Ndị mmadụ gbara ụlọ ụka Sotitobire dị n'Akure ọkụ maka akụkọ ndị uweojii sị bụ asị na-efegharị na soshal midia. Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu n'ụlọụka ahụ. Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụọ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. 4) Emume ncheta ọmụmu onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchi 17 nke ọnwa Disemba a. Ozi nwunye ya bụ Aisha Buhari dere na Twitter butere ọtụtụ akụkọ. 5) Kamaru Usman Kamaru Usman bụ nwaafọ Naijirịa ma bụkwa onye ama ama n'egwuregwu 'MMA' meriri mgba ma ka bụrụkwa okaibe ji mgba n'ụkwụ nke ndị UFC. 6) 6 years single Term : Atụmatụ onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Ndị ụloomeiwu nta ewepụla atụmatu ime ka onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Otutu ha kagburu ya ma sị na onweghị ihe mere etu ọ dị ugbụ a. 7) Onwụ Benjamin Uwajumogu Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa nwụrụ n'ụbọchi nke asatọ n'ọnwa Disemba 2019. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijirịa zitere ezinụlọ ya ozi itiakanobi. 8) Naira Marley Otiegwu ama ama bụ Naira Marley wuru n'izu a ọkachasi maka egwu ọhụrụ a na-agba nke ọ kpọrọ Tesumole. Ihe ọzọ mere ka nwaokoroobia ji pụrụ onye akpụ n'ọnụ bụ egwu ohụrụ otipụtakwara n'izuụka nke ọ kpọrọ 'LOL- Lordoflamba'. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53533398,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53533398,Premier League table: Chelsea na Manchester United azọọla Leicester City ụkwụ n'isi wụfere,Manchester United na Chelsea ga-eso agba Champions League nke afọ 2020/2021 dịka Premier League nke afọ a pịachiri taa.,"Goolu abụọ asataghị otu Man Utd ji merie Leicester City, na abụọ asataghị otu Chelsea ji merie Wolves, mere ka nke a dị ire. Man Utd pịachiri afọ a n'ogogo atọ na tebulu, ebe Chelsea gbazịrị onye anọ. N'agbanyeghi na ha abụọ nwechara pọịntị 66, Man Utd ji ndịiche goolu gafere ha. Ndị nyerela Man Utd goolu bụ Bruno Fernandes ji penariti VAR kwuru na ọ dabara, nye goolu na nkeji 71, tupu Jesse Lingard emezuo ya abụọ na nkeji 90 na ụma. Ebe Mason Mount nyerela Chelsea goolu nke mbụ na nkeji 45. tupu Olivier Giroud atụkwasị ya nke abụọ na nkeji 45 na ụma. Lee etu e si kwụrụ n'ahịrị na tebulu Premier League mgbe a pịachiri taa. Jamie Vardy nyere goolu 23 na Premier League n'afọ a, nke mere ka ọ bụrụ onye ritere akpụkpọụkwụ olaedo a na-enye onye kacha nye goolu n'otu afọ. Nke a mere Vardy dị afọ 33 onye kacha kaa nka riterela nturugo a. Ederson nke Manchester City ritere mgbanaka ọlaedo dịka a na-enyeghi ya goolu n'egwuregwu 16 n'ime 38 a gbara." afirika-44721205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44721205,Agbanyeghi na odeshi na-eshi ndị mmadụ ka kwenyere na ya,"Otu akụkọ ndị mmadụ na-atụ ndị mmadụ n'anya na soshal midia bụ na otu nwoke aha ya bụ Chinaka Adoezuwe nwụrụ mgbe enyi ya nwoke gbara ya egbe n'obodo Umuozu Ugiri, nke dị na okpuru ọchịchi Isiala Mbano n'Imo steeti.","Ọtụtụ ndị na-anwa mgbo egbe na-eji udiri egbe a, bụ kari nke eji agba nta n'ime obodo Akukọ nke ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ bu, kwuru na Adoezuwe, bụ onye dibia, nwụrụ mgbe ọ na-achọ ịmata ka ọgwụ odeshi ọ gwọrọ ọ dị ire. Onye gbara egbe a bụ Chukwudi Ijezie, bu onye Adoezuwe gwọọrọ ọgwụ odeshi a. Agbanyeghị na Ijezie kwuru na ọ bụ Adoezuwe sị ya gbaa ya egbe ahu, ndị uweojii kpara ya aka maka ogbugbu mmadụ. Agbanyeghị na ọ na ada ka akuko ifo, ọbụghị ihe ọhụrụ na mpaghara ọwụwa anyanwu makana odeshi bụ ihe ụfọdụ ndị na-achọsị ike. N'afọ 2012, n'obodo Agbatse nke dị n'okpuru ochịchị Kwande na Benue steeti, Ornguga Adega gbagbụru otu nwa nwoke o nwere ka ọ na-eme ka ọ nwale ma odeshi ya ọ na-arụ ọrụ ọfụma. N'akụkọ ụlọ ntaakụkọ Vanguard dere mgbe o mere, ha na-akọ na Adega gotere odeshi n'aka dibia were tee ya n'ụkwụ nwa ya, tupu ọ tụkwasị ya egbe, gbarịe nwata ụkwụ. Nwata ahụ dị afo 10, nwụrụ tupu ndi dibia Bekee rute ya nso. Ọtụtụ mmadụ kwenyere na ọgwụ na-ere Ọzọ dikwa ka ibe ya mere n'ọnwa Disemba nke afọ gara aga n'obodo Kakumi nke dị n'okpuru ọchịchị Bakori na Katsina steeti mgbe Usman Saidu dị afọ 45 si ka ya leta ka odeshi ọ gwọrọ Aliyu Yahuza ọ ga-ere. Ka Yahuza ṅụchara ọgwụ a, Saidu tụkwasara ya egbe were zi. N'ime akụkọ ndị a niile, ndị uweojii kwusiri ike na ndị gbara egbe gbụru ndị a dara iwu, nke mere aka jiri jide ha. Mana, ihe akụkọ ndị a pụtara bụ na ụfọdụ ndị mmadụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ kwenyere na ha nwereike nweta nchekwa site n'aka odeshi ndị dịbịa mere ha. Ọzọkwa bụ na ndị mmadụ ka nwekwara ofufe n'ọgwụ Igbo agbanyeghị na udiri akụkọ a na-apụta. Onye dọkinta Bekee na-ahu maka ụbụrụ na 'National Neuropsychiatric Hospital' di na Legọs bụ Dami Ajayi kwuru na ya echeghi na o nwere etu sayensi ga-eji kọwa ihe mere ndị mmadụ ji nwe udiri ntụkwasị obi n'ebe odeshi nọ, agbanyeghi na agba ọhụrụ nwere ike a na-eyi ya ka uwe. Ndị kwenyere na dibia Igbo karịrị na mpaghara anyanwu a Ajayi kwuru na ihe a ndị mmadu na-eme na-egosi na ha ka nwere nchekwube na ngborọgwụ Igbo. O kwukwara na udiri ihe a na-eme n'udi dị icheiche dịka ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ndị na-agba ọkpụkpụ Igbo ka nke Bekee mma, nakwa na ọgwụ Igbo ka nke Bekee mma maka ụfọdụ ọrịa. N'okwu dọkinta Ajayi, anyị ka ga na ahu udiri ihe a na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46347080,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46347080,ASSU Strike 2018: Kpọghachị ụmụ anyị n'ụlọakwụkwọ - Ndị nne na nna,Akụkọ dị mkpa: Akwa nne na nna na-ebe maka abụbọ ọrụ,"Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ndị nne na nna akpọkuola Gọọmentị etiti ka ha biko gbata ọsọ enyemaka n'okwu banyere abụbọọrụ ndị nkuzi mahadum ka ụmụ ha nwee ike laghachị n'ụlọakwụkwọ. Cheta na mkparịtaụka gọọmentị na ndị nkuzi nwere ụnyaahụ amịtaghị mkpụrụ dịka amabeghi mgbe nke a ga-ebi. Nwoke ọzọ apụtala na ndụ n'ụlọelu dara na Pọrtharcourt Ndị ọchịchị steeti Portharcourt ekwuola na ha na-enyocha ihe a mere nụ. Otu nwoke apụta na ndụ site n'ụlọelu dara na Pọtharcourt nke Rivers Steeti n'ime ụbọchị atọ ụlọ ahụ dachara. Otu onye ọrụ nchekwa Civil Defence gwara BBC na akpọpụtara nwoke ahụ n'otu onye ọzọ nwụrụ anwụ n'abalị ụnyaahụ. Na mba Saụt Afrịka Na mba ọzọ mba Saụt Afrịka ebuliela ụgwọ opekatampe ndị ọrụ ha rue ego dị otu narị puku iri abụọ na isii nke ga-amalite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019. Nke a na-abịa dịka Naịjirịa na ndị ọrụ ya na-agba mgba ka e bulie nke ha rue narị puku iri atọ. N'egwuregwu Asọmpi Uefa Champịọns ga-amalite ọzọ, dịka Roma ga-ele Real Madrid ọbịa, Lyon ga-anabata Manchester City. Ebe Juventus, Valencia, Manchester United, CSKA Moscow, Young Boys na ndị ọzọ ga-anọkwa na-egwu. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Alex Otti: Ihe mere na Ndigbo anaghị etinye ego n'imepe ala Igbo Otu onye uweojii gbagburu nwunye ya na nwanne ya nwoke n'ime ụlọikpe dị n'obodo Durban dị na mba Saụt Afrịka, ụnyaahụ bụ Nọvemba 26, 2018. Akụkọ kwuru na nwoke ahụ na nwunye ya gara ụlọikpe ebe ha tinyere akwụkwọ alụkwaghịm, mana ka a gara ezumiike nkeji 15, ọ batara were egbe gbaa nwunye ya na nwanne nwunye ya. Ọ nwakwara ịgbagbu onwe ya ozugbo, mana e burula ya gawa ụlọọgwụ, ebe ụlọntaakụkọ news24 kwuru na o mechaala nwụọ maka mmerụahụ ọ merụrụ. Anambara steeti Gọọmentị Anambara steeti na ndị Igwe si mpaghara ọwụwa-anyanwụ, ahọpụtala ụbọchị iri abụọ na asatọ nke Disemba dịka ụbọchị ha ga-eji mee emume ibibi omenaala osu na mpaghara ahụ. A ga-eme emume a n'obieze ndị Nri. N'akụkọ ọzọ, Otu pati APGA ekwuola na ha ga-amalite ịchụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala n'Awka, n'ụbọchị isii nke ọnwa Disemba. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na o kweteghị n'akụkọ na-ekwu na ọ bụrụ na mba ya etinyeghị anya na mmebi ihu igwe Bekee kpọrọ ""global warming"", na ọ ga-akpa mkpamkpa n'akụnaụba ha. Akụkọ ahụ kwuru na na mmebi ihu igwe a ga-efu Amerịka ọtụtụ ijeri dọla kwa afọ ma mmebikwaa ahụike ha. N'egwuregwu, Otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons, ga-ezute Kamerun n'asọmpi Iko mba Afrịka a na-agba na Gana. Cheta na mba atọ ga-apụta n'asọmpi a, ga-aga asọmpi Iko Mbaụwa a ga-agba na Frans n'afọ 2019. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Alex Otti: Ihe mere na Ndigbo anaghị etinye ego n'imepe ala Igbo" afirika-52010576,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52010576,Ifeanyi George: Ọnwụ gburu anapụla Rangers na Naijiria nnukwu 'striker' - Davidson Owunmi,Onyeisi na-elekọta Rangers bụ Davidson Owunmi ji anya mmiri gwa BBC na ọnwụ Ifeanyi George na Emmanuel Ogbu bụ ihe ahụ ọmajijiji nye ndị otu ha.,"Ọ kọwara na Ifeanyi, onye nke nọ n'otu bọọlụ nke nnukwu ha kpọrọ 'senior team' na Bekee bụ Emmanuel Ogbu onye nke nọ na 'feeder team' na otu enyi ha nwoke oge ha na-ala Legọs maka ezumike izu ụka abụọ e nyere ha maka egwu Coronavirus. Ha nwere ya bụ ihe mberede ebe a na-akpọ Benin ""bypass"" oge ụgbọ ala ahụ Ifeanyi na-anya gbabara n'okpuru nnukwu ugbọala kwụrụ onwe ya, ha atọ nwụnyụrụ anya pii. Owunmi kwuru na ha na ndị ezinaụlọ nwa amadị ahụ akpaala ka aga esi lie ozu ya, okwukwara na gọmenti Enugwu na akwụchi insurance anya. Onyenkuzi ndị ụmụaka ndị Rangers, PRO nakwa onyeisi otu ndị nkwado ha kwuru na obi dị ha nwute nke ukwuu na ụmụ aka ha ji eme ọnụ nwụrụ na mberede. Onye bụ Ifeanyi George nwụrụ anwụ? Ifeanyi George si Enyimba banye Rangers International FC na 2016 Otu onye egwu bọọlụ Rangers International nke Enugwu ji eme onụ bụ Ifeanyi George alaala mụọ n'ụtụtụ Sọnde. Ifeanyi nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ ka o si Enugwu aga Legọs. Dịka akụkọ siri kwuo, ọ bụ ya na mmadụ abụọ ọzọ nọ n'ime ụgbọala oge mberede a mere. Otu egwuregwu bọọlụ Rangers kwuru n'ihe a mere n'akara Twitter ha. Ọtụtụ ndị ihe ya na amasị na-ezigara ezi na ụlọ ya ozi itiaka n'obi na soshal midia. Foto ndi mmadu setere n'ebe mberede mere gosiri na ụgbọala ya banyere n'okpuru ụgbọala. Akụku na-ekwu na nwaamadị a nọ n'ụzọ ịlaghachị ebe o bi na Legọs dị ka akagburu asọmpị premiership na Naịjirịa oge ihe a mere. Ifeanyi George na-agbaburu Enyimba nke Aba bọọlụ. E nwere ihe ruwere ndị egwubọọlụ dịka Ifeanyi? Onye nchịkọta ndị Rangers FC bụ Davison Owumi kwuru na-agbanyeghị na ha bụ anyammiri n'isi maka ọnwụ Ifeanyi na onye otu ya, na ndi egwubọọlụ niile aha ha dị n'akwụkwọ ndị Nigeria Professional League nwere ezigbo ihe nrite ma ọbụru ma ihe mee ha. Owumi kwuru na steeti kwunyere ụgwọ n'isi ụmụ Rangers n'ụlọọrụ Premiere Brokers Insurance maka ihe ntụmadị ọbụla rụọ n'afọ 2021. Akwụkwọ ọdeakwụkwọ otu egwubọọlụ ahụ bụ Emeka Ferdinand Ugwuerua tinyere aka na-egosi na ezi na ụlọ Ifeanyi ga-enweta ọkpụrụkpụ ego dị nde kwuru nde maka ọdachị ahụ dakwasara ha. Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49173023,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49173023,Emeka Ihedioha : Anyị niile bụ nwanne na PDP,Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha ekwuola na otu PDP na steeti ka bụ otu n'agbanyeghị mpụtara ikpe Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa nyere gbasara onye ji ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019.,"Ulọikpe kachasi na Naịjirịa nọrọ ụbọchị Tuzde kpebie na ikpe amaghị Ihedioha n'akwụkwọ nke Senetọ Samuel Anyanwu gbara nke o boro ebubo na PDP Imo steeti họputa Ihedioha n'ụzọ ezighị ezi ịzọ oche gọvanọ Imo steeti. Ihedioha egosiri obi ụtọ ya na mmeri nke Ụlọikpe Kachasị nyere ya ma rịọ ka ndị Imo steeti niile, n' agbanyeghị otu ndorọndọro ọchichị onye nọ na ya, gbakọta bia tinye aka ka ha dozie Imo steeti. N'okwu ya site n'ọnụ onye nnyemaka pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Ihedioha bụ Steve Osuji, o kwuru na ""na-agbanyeghị na ha nabatara ikpe a, na ihe mere bụ n'etiti umunne."" ""Anyị bụ otu n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP."" Emeka Ihedioha: M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti O kwukwara na ha nwere olileanya na ikpe agaghị ama ha na akwụkwọ niile a gbara ha ka dị n' ụloikpe. Ebubo a bidoro dịka Ihedioha jiri votu 1,723 were merie Anyanwu onye nwetara 1,282 n'onwa Oktoba n'afọ 2018 mgbe ndị PDP nke Imo steeti mere nhọputa. Imo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri ' Onye ọkaikpe John Okoro kara ikpe a were si ""onye gbara akwụkwọ enweghị ike igosi na ebubo ya bụ eziokwu nke mere na ikpe ya esighị ike"" O kwukwara na ""Onye gbara akwụkwọ ga akwụ kwa onye ọ gbara akụkwọ N200,000 """ afirika-50299413,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50299413,Odumegwu Ojukwu: Obi adịghị ndị Igbo mma n'ọnọdụ ha nọ na Naịjirịa,Akụkọ dị mkpa Obi adịghị ndị Igbo mma nọ n'ọnọdụ ha - Ike Ekweremadu,"Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata Onye bụbu osote onyeisi ndị Sịnetị bụ Ike Ekweremadu sị na obi adịghị ndị Igbo n'ime ọnọdụ ha nọ na Naịjirịa, na e nwere ọtụtụ ihe kpatara nke a. O kwuru nke a n'ọgbakọ ọmụmụ ihe nke ncheta ọnwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'ụbọchị anọ nke Nọvemba, 2019 na Mahadum Ojukwu dị n'Anambra Steeti. Ekweremadu bụ onyeisioche ọgbakọ a sị na ọ bụ ezughi oke dị n'obodo Naịjirịa butere mkpasu iwe niile a. Ọ sị na o kwenyere na ndị Igbo ga-egosipụta ike ha n'uju maọbụrụ na a hazigharịa Naịjirịa. N'aka nke ọzọ onye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha pati Young Progressive Party bụ Kingsley Moghalu sị ka Yakubu Gowon bụbu onyeisiala Naịjirịa ka o kwuo eziokwu maka ogbugbu e gburu ndị Igbo n'oge agha. Ọ sị na ọ bụ ihe ọjọọ ka Naịjirịa soro na-eme emume ncheta ogbugbu ndị mmadụ na Rwanda ebe e mere nke ka njọ na Naịjirịa na-ekwupụtaghị ya. Bianca Ojukwu ekwuola obi ya Bianca Ojukwu bụ onye meriri n'asọmpị 'nwaanyị kachasị maa mma' na Naịjirịa nke afọ 1988 ""Obiano, ihe ncheta Ojukwu hapuru anyị na-anwụ n'ihu gi?"" Nke a bụ okwu Bianca, nwunye Odumegwu Ojukwu kwuru n'emume ncheta Dikeogu bụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'Awka. O kwuru na gọvanọ steeti ahụ anaghị etinye anya na mkpụrụ Ojukwu kụrụ maka ndị Igbo. Bianca, onye bụbu onye nnọchite anya Naịjirịa na mba Spen, bere akwa a na ya bụ ọgbakọ emere na Igbariam, Anambra steeti. O kwuru na All Progressives Grand Alliance (APGA) bụ pati nko Ojukwu hibere sọ na ya bụ ntọala. Bianca kwara arịrị na Gọvanọ Obianọ abịaghị ya bụ emume dịka ọ mere na nke mbụ. Ọ gwara osote gọvanọ steeti ahụ bụ onye nọchitere anya gọvanọ ahụ ya zie ya na ""ọtụtụ ntọala Ezeigbo hibere na-anwụ n'ihu ya"". ""Zie ya na enweghị ajọọ mmụọ nọ ebe a"". Bianca bokwara Obiano ebubo ịgbahapụ ndị niile nyeere ya aka ịrigote n'ọkwa gọvanọ. O kwukwara na ọ dịka ka akpachapụru anya ịbịachi ahụhụ a tara n'agha Biafra nke ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata ebe ha na-aga. Anambra na Delta kee nkwụcha maka idemmiri Edo, Anambra, Delta, Bayelsa na Rivers steeti keenụ nkwụcha maka idemmiri na-abịanụ? Nigerian Hydrological Service Agency (NHSA) na-adọ steeti ndị a aka na ntị ka ha kwado onwe ha maka idemmiri na-abịa. Anyị nụrụ na gọọmenti Cameroon sị na ha ga-emeghepụ ụzọ ọdọmmiri Dam ha iji mee ka mmiri putu na ya. Onyeisi ụlọọrụ NHSA bụ Clement Nze kwuru na ndị gọọmentị Cameroon agbaghị ya bụ ama n'oge agbanyeghị ụgboro ole maọbụ ole ndị Naịjirịa degagoro ha akwụkwọ. Nze sị ya bụ ntọhapụ ndị Cameroon tọhapụrụ ya bụ ọdọmiri mere idemmiri ji dị n'Adamawa, Taraba, Benue na Kogi steeti. Nke a mere ha ji agbara ndị Kogi, Edo, Delta, Rivers, Bayelsa, Anambra ama ka ha kee nkwucha. Okwuru na idemmiri ga-esi na steeti ndị a gafee tupu ọbanyekwa na Oshimiri nke Atlantic. Tunyenu Stella Adadevoh ugo Stella Adadevoh Ndị ụlọomeiwu nta agwala gọọmentị etiti ka ha tunye Stella Adadevoh ugo pụrụ iche n'ihi ike ọ kpara iji kwụsị mgbasa ọrịa ebola na Naịjirịa. Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha n'ụbọchị Tuzde. Ha dọkwara aka na ntị ka a gbaa mbọ hụ na e mere ihe niile iji gbochie ọrịa ọjọọ ahụ ịbata obodo Naịjirịa ọzọ. Amerika sị na ha ga-apụ na nzụkọ mbara enigwe Ụmụibe Amerika ekwuputala mmasị ha ịpụ n'otu UN na-ahụ maka ọdịmma mbara enigwe. Nke a bụ nzọ ukwu nke mbụ ha n'usoro isepụ aka na ya bụ nkata mba ụwa na-akpa maka ọdịmma mbara enigwe. O teelarị aka onyeisiala Donald Trump ji kwuwe na Amerịka ga-esepụaka na nkwekọrịta 'climate change', mana ugbua ka ya bụ ije iji sepụ aka na ya malitere n'uju. Tanker ọzọ adaala n'Imo steeti Ọ dịka Tanka ọzo bụ mmanụ ụgbọla adaala n'ụzọ sitere Nkwọ Umụezeala, nke dị na Mbanọ , Imo steeti. Ihe onyonyo na-egosi bebe ndị mmadu ji mmiri ncha azachapụ mmanụ ụgbọala ka ọ hara ịnwuru ọkụ. Lionheart apụọla n'Oscar Igbo bụ Igbo nke na-akpọtụ ugbua bụ na-ewepụla Lionheart nke Genevive Nnaji dịka ihe nkiri ga-anọchite anya Naịjirịa n'Oscar. Ndị na-ekpokoba ya bụ ihe sị na-ejighị asụsụ Naịjirịa mee ya. Pinnick Alaferela Amaju Pinnick bụ onyeisiala NFF Gọọmentị etiti akụchapụla akwụkwọ ha gbara Amaju Pinnick bụ onyeisi otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa a kpọrọ NFF. E boro Pinnick ebubo na o zuru ego ruru nde naịra anọ dịka onyeisi NFF, mana ugbua ụlọikpe asịla ya lawa na ikpe amaghị ya. Gee akụkọ ndị a na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" afirika-47010572,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47010572,Atiku's Endorsement: Onweghi ihe Buhari ga-eme Igbo ga-aka nke o merela - Nnia Nwodo,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kwuru na ntuliaka 2019 bụ mgba dimkpa abụọ na-agba.","Ha hara otu onye n'ime ha na-ekwu ihe Ndigbo kwenyere na ya bụ nhazigharị Naijiria nke a kpọrọ, ‘Restructuring’, na bekee. Nwodo kwuru na e nwe nhazigharị Naijiria, Ndigbo agaghị na-achọ ọrụ ahapụ Alaigbo n’ihi na a ga-enwe ọganihu dịka ọ dị gboo oge e nwere ọchịchị na mpaghara, na mpaghara. “Anyị nwe restructuring, ị gaghị hapụ Alaigbo gawa ebe ọzọ ịchọ ọrụ."" O kwuru na n’agbanyeghị na APC kwere nkwa ihazighari Naijiria tupu ha abanye n’ọchịchị, o nweghị ihe Buhari mere iji weta ya na mmezu. “Ọ kpọghị Constitutional conference ka a kpa etu aga esi mee restructuring.” N’okwu na Peter Obi agaghị enwe ikike ọbụla dịka osote onyeisiala, ọ kọwara n’iwu Naijiria na osote onyeisiala bụ onyeisi nhazị akụnaụba. Gee ihe o kwuru n’uju: Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-47575707,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47575707,FA Cup: Wolves agwọọla Man Utd ara,"Ka ọ dị ugbua, Wolverhampton ga-eso gbaa agba nke ngwụcha-ikpeazụ iko FA, ebe Man Utd ga-anọ n'ịta ikikere eze.","Goolu abụọ Raul Jimenez na Diogo Jota nyere na nkeji 70 na 76 zuru itinye Man Utd na gbagharịa. Ndị Wolves emeghi ebere ka ha gbakasịchara Man Utd ahụ, mee ka ha sie ""bọọlụ bọọlụ"". Marcus Rashford mechara chọta ụkwụ ya n'azụ poostu na nkeji 90 na ụma, mana nke ahụ ezughi ịkwụsị ụgbọ bu Man Utd ala kanaị. Akwụkwọ edo edo e ji adọ aka na ntị rịrị ibe ya elu n'egwuregwu a ka ma ndị Man Utd ma ndị Wolves metachara ihe e ji dọọ ha aka na ntị; ogbuopi ji akwụkwọ a dọọ mmadụ asatọ aka na ntị. E nyere Victor Lindelof akwụkwọ nchụpụ, mana ka e nyochara VAR, ogbuopi budatara, nye ya naanị nke ịdọ aka na ntị. Mmeri Wolves mere ya mbụ ha na-eru agba ngwụcha-ikpeazụ n'ime afọ iri abụọ na otu. Ka ọ dị ugbua, emeriela Ole Gunnar Solskjaer ugboro abụọ so ibe ya n'azụ. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-50361806,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50361806,Leicester City vs Arsenal: Leicester City ewerela egbe ndị Arsenal gbawaa ha isi,Ndị otu egwu bọọlụ Leicester City ji egbe ndị Arsenal wee gbawaa ha isi n'asọmpị 'English Premier League' nke taa.,"Ọkpụ goolu abụọ chara acha ka ha ji wee dulaa ha mmụọ. Jamie Vardy gosiri na ike agwụbeghị ya chaa mgbe o nyere goolu nke mbụ na nkeji 68. James Maddison gbakpukwara goolu nke abụọ na nkeji 75. Wilfred Ndidi na Mesut Ozil Arsenal enwetaghị onwe ha chaa chaa na ya bụ Asọmpi. Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi ekweghị Mesut Ozil megharịa ahụ Mmeri a mere ka Leicester gbagorokwa na ndị nke abụọ na tebulu EPL. Arsenal n'onwe ha bụ ndị nke isii. Akara iri na atọ ka Liverpool ji agafe Arsenal ugbua. N'asọmpi ndị ọzọ Tammy Abraham nyetaara Chelsea goolu. N'egwuregwu ndị ọzọ, Chelsea pịawara Crystal Palace azụ mgbe ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ha. Nwaafọ Naịjịrịa bụ Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyeere ha goolu. Everton bụ ebe nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi nọ, meriri ndị Southampton 2-1. Newcastle merikwara Bournemouth 2-1, ebe Tottenham na Sheffield United nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria" afirika-46286036,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46286036,My Transition Hours: Ihe atọ dị mkpa dị n'akwụkwọ ọhụrụ Jonathan dere,Aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ na-ata ya ụta ihe mere o jiri nyefe ọkwa ọchịchị na 2015 karịa ịzọ ya n'ụlọ ikpe.,"O kwuru n'ọgbakọ ebe o wepụtara akwụkwọ ọhụrụ o dere nke ọ kpọrọ ""Transition Hour"" ""E nwere ọtụtụ ihe ejiri megide m. Ihe dịka Boko Haram na ụmụaka Chibok."" 1. Jonathan kwuru na Obama megidere ya na ntuliaka 2015. "" Obama wepụtara ihe onyonyo ọ nọrọ kpọọ ndị Naijiria oku gwa ha etu ha ga-esi tu vootu dịka ọ gwara ha ka ha jiri vootu ha bido 'agba ọhụrụ ma wepụ gọọmjenti n'achịnụ'."" 2. O kwuru na ọdachi ụmụaka Chibok dịka nkata a kpara megide ya. ""Ebee ka ndị isi ụlọakwụkwọ, ndị ọrụ nchekwa, ndị nkuzi na onyeisi ụlọakwụkwọ Chibok nọ mgbe ihe na-eme? ""Ọ dị nọọ ka ihe a kpara ya akpa dịka ngaghariiwe sochiri ya n'akụkụ ala anyị. Ndị niile dika ndị ndọrọndọrọ ọchịchị tinyere aka were ọdachi ahụ mere ihe ndọọndọọ ọchịchị."" Ekwenyere m n'otu ụbọchị, ndị ọkacharamara n'ihe gbasara nchekwa na ndị sonyere n'ịchọ na ịzọpụta ụmụaka ahụ ga-agwa ụwa eziokwu ihe mere na ntọrị ụmụaka Chibok."" 3. Ọ kpọrọ Inec oku ka ha gbaa mbọ inye aka kwụsị oke izu vootu nke na ari elu ugbua dịka ana akwado ntuliaka 2019. ""Nsogbu izu vootu akarịala na Naijiria. Ebe mba ndị ọzọ machịri ya , na Naijiria ọghọla omenala. Nke a adịghị mma. "" Ana m atu alo ka anyị lebanye anya n'etu anyị sị arụ ọdọ ntuliaka (polling booth) ṅomie mba ndị ọzọ jị ụlọ ndị gọọmenti ha eme ya."" Akụkọ ga-amasị gị" 56245386,https://www.bbc.com/igbo/56245386,Enugu Water: Gọọmenti Enugwu steeti ahọpọpụtala Martins Okwor dịka onyeisi ọhụrụ ngalaba mmiri,Aka na achị steeti Enugu bụ Ifeanyị Ugwuamyi ahọpụtala Onyeka Martins Okwor dika onyesisoche ọhụrụ nke ụloorọ na ahụ maka mmiri.,"Nhọpụta a mere taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị. Odeeakwụkwọ gọọmenti Enugu bụ Ọkammụta Simon Uchenna Ortuanya kwuru na nwaamadia bụ onye Ikem dị na okpuruọchịchị IsiUzo dị na steetiu ahụ. O kwukwara na ọ rụọla ọrụ n'ihe gbasara mmiri gafee afọ iri atọ. Cheta na ndị Enugwu bere akwa mmiri kemgbe abalị olenaole gara aga dịka ụkọ mmiri na-anyụ ha anya ebe ahụ. Ndị bi ebe ahụ sị na o ruola nke bụ na nri dị mana mmiri eji esi ya adịghị. Otu onye BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na, ""O meela ụbọchị olenaole anyị ji ata ezigbo ahụhụ maka ụkọ mmiri n'Engugwu"". Gọọmeti Enugu steeti ekwuola na ha na-arụgharị ọwa mmiri pọmp n'Enugwu na ọ bụ ya butere ya bụ ụkọ mmiri. Kọmishọna na ahụ maka mmiri na steeti bụ Dubem Onyia Jr ahụ sị na ọ ga-erucha Ọgọst 2021 tupu o bie." egwuregwu-48957618,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48957618,Frank Lampard Out: Gịnị mere e ji asị Lampard 'buru ngwongwo gị laa'?,"Na-erughi otu izu Chelsea kpọpụtara aha Frank Lampard dịka onye nchịkọta ọhụrụ ha, ndị na-akwado otu a ekwuwela ka a chụọ ya n'ọrụ.","Frank Lampard bụ onye kacha nyerela Chelsea goolu kemgbe ha bụ otu egwuregwu, site na inye goolu 211 Ndị na-akwado ha ekweghi ka ike ya nọrọ ala ọfụma n'oche dịka onye nchịkọta, tupu ha amalite ịkpọku ndị were ya n'ọrụ sị ha sepụ oche ahụ. Ha bidoro ihe a kpọrọ ""#LampardOut"" n'elu soshal midia. Gịnị bụ iwe ha? Ha na-aba mba na na-emebeghi eme ọ mawala ụkwa dịka onye nchịkọta; nke a si n'onye lawa onye lawa ndị Chelsea na ndị Bohemian dị n'obodo Dublin, Ireland, gbara na ""pre-season"" ha. Ebe ụfọdụ kwuru ka e nye ya ohere makana o tebeghi aka ọ batara nchịkọta, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụdịrị ihe a mere ha ji atụ ụjọ maka ọchịchị e nyere ya. Ndị ọzọ kwuru na maka ụdịrị ike ọ kpaara Chelsea oge ọ na-agba bọọlụ, na ọ gaghị amasị ha ka ọ bata mechuo ihu ya na aha ya. Mana a maliteka ya n'oge itiwe mkpụ ọpụpụ ya? Nye ụfọdụ ndị, ọ gbasaghị ha na ọ bụ naanị mkpụrụ ụbọchị isii ka ọ nọrọla n'oche nchịkọta Chelsea tupu ha agbaa bọọlụ ahụ. Ndị dịka @SgtCrackers kwuru sị ka ọ pụọ ugbua chi ka dị. Otu onye gara mepee akara Twitter ọhụrụ ọ kpọrọ ""@LampardOutCFC"", ebe ọ nọ kwuo ka a chụọ Lampard ụkwụ eru ala ma kpọghachịta Jose Mourinho chịkọburu Chelsea. @charlesomolo15 kwuru sị ndị mmadụ kwụsịkwa ịkpa ""agwa ọjọo"" a. @adesanyadarking dere sị na ọ gbagwojuru ya anya na ndị mmadụ ga na-achọ ka a chụọ Lampard. Kedụ ụdịrị egwuregwu na-amasị gị? Egwuregwu na-amasi anyị" afirika-48928763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48928763,House of Rep Principal Officers: 'Femi Gbajabiamila sị na iwe ya bụ na PDP etụnyeghịrị ya na ntuliaka',"Ọnụ na-ekwuru onyeisi ndị PDP bụ Ike Abonyi ekwuola na pati ha ma na ihe na-eme n'ụlọnọchite anya nta gbara ọnye ga a bụ ""Minority Leader"" bụ mgba okpuru.","Abonyi kwuru na PDP ehiwela kọmiti ga-elebe anya na ya bụ okwu mara ebe ya bụ mmiri sị banye opi ụgbọnyiri. Ọ sị na ya bụ kọmiti nke ndị isi pati ha na ndị ọkpamkpọ hibere na Tuzde nwere otu izuụka iji kwuo nchọpụta ha. Abonyi sị na ""ọrụ kọmiti a bụ ịchọ ka ga-esi weta udo"". Ọ kwesiri ike na ọ bụ mgbaokpuru mere onyeisi ụlọnta omeiwu bụ Gbajabiamela ji hapụ aha pati nyere ya kpọwa ọzọ. Ụlọnọchite anya nke nta enweghị ezumike kemgbe izuụka gara aga maka okwu ihọpụta onye isi pati akacha nke atụrụ anya na ndị pati niile bụ ndị anọghị n'ọchịchị ga-ewepụta. Onyeisioche ya bụ ụlọnọchite anya bụ Femi Gbajabiamila kpọpụtara aha Ndudi Elumelu (PDP) dịka onye pati ndị a niile chọrọ. BBC gbara ndị ihe a metutera ajụjụ ọnụ ịmata nke bụ eziokwu. Kingsley Chinda, onye bụ onye PDP kwadoro gwara anyị uche ya. Chinda sị na ya atụghị anya na ya bụ okwu ga-aga ka ọ gara maka na uche ya adịghị na ya bụ ọkwa maka na ọ bụ nhọpụta ka a na-ahọpụta onye ga-anọ na ya, na ọ bụghị ntuliaka. Okwuru n'ọgbakọ pati niile anọghị n'ọchịchị ugbua nwere n'Abuja na ha niile tikorọ isi ikwu udi ihe onye ga-anọ na ya bụ oche Minority Leader kwesiri ịnwe. Chinda sị na ""mmadụ ise họpụtara m ebe otu onye họpụtara Ndudi Elumelu."" Ndị bịara ya bụ ọgbakọ gara n'ihụ ịgwa ndị isi ka ha ga nyocha mmadụ abụọ ahụ ahọpụtara ma nye ha otu onye. Akpọrọ ọgbakọ ọzọ n'abalị mbụ nke ọnwa Julaị ebe pati niile anọghị n'ọchịchị gbakọrọ ma lebe ka ndị nke Sineti siri mee nke ha. Ebe ahụ ka Tobi Okechukwu kwuru na ndị Ọwụwa Anyanwụ ga-achọ ka ewere ntuliaka wepụta onye ga-anọchite anya ha karịa nhọpụta dịka emere na mbụ. Wole Oke kwukwara ndị otu ha n'Ọdịda Anyanwụ kpokotara mbinyeaka ndị otu ha. Ndị isi rịọrọ ka ahapụ aha ndị nke họpụtaburu ka ha gawa kemgbe ọ bụghị iwu na a aga eji ntulika wepụta ndị ga-anọ na ya bụ oche. Onye APGA bụ Presige Osy rịọrọ na kemgbe etinyeghị ha na oke nke a, na ha ga-achọ ka echetakwa ha mgbe ọzọ a ga-eke ọkwa. Chinda kwuru na ""iwu ụlọnọchite anya bụ na pati ọbụla na-erughị iri agaghị anọ n'isi oche obụla. Kemgbe APGA bụ ndị nwere oche itoolu anaghị atụ anya isi oche ọbụla"". Ekwere ha nkwa na a ga-eme ka ha soro n'ihe a na-eme. Chinda sị na-emechere hụ ka ụfọdụ na-ebugharị akwụkwọ na-arịọ ka ndị otu ha na-etinye aka. ""Anyị amaghị ihe ha chọrọ iji ya bụ akwụkwọ mee."" Ọ sị na ya gara n'ụlọọrụ onyeisi ya bụ ụlọnọchite anya nke nta bụ Femi Gbajabiamila ịjụ ya ma onwetala akwụkwụ ndị pati PDP deere ya maka nhọpụta ha mere, ọ sị na ya nweteghị ya. Chinda sị na mgbe ya gachiri azụ ịjụ ya, ka Gbajabiamila gwara ya na onwere aha ndị ọzọ enyere ya nke ndị pati ndị ọzọ niile tinyere aka, ọ bụ nke ahụ ka ya ga-agụpụta. Ọgwakwara ya na PDP etinyeghị ya na ntuliaka, ya mere ya agaghị akpọ aha ndị nke ha ziteere ya. BBC kpọrọ Toby Okechukwu na Ndudi Elumelu mana ha azaghị ekwenti Akụkọ ga-amasi gị Lee ihe nkiri a Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ" afirika-46779421,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46779421,Traffic Jam: Etu ị ga-esi gbalarị kpachi kpachi okporoụzọ,"Anyị agbachaala ihe niile a na-agba agba, ọrụ ebidola.","Eziokwu bu na ọrụ bidoro kemgbe abalị abụọ ọnwa Jenuwarị a, mana ọ bụ taa bụ ụbọchị nke asaa n'ọnwa Janụwarị ka ụmụakwụkwọ bidoro. Ya bụ na okporoụzọ abụghịzi siriri werere ka o si dịbu mgbe ọtụtụ mmadụ nọ n'obodo ha enwe aṅụrị ekeresimesi. Okporoụzọ ebidola kwowe ekwo, onye ọbụla chọrọ iru ụlọọrụ n'otu oge. Anyị sị ka anyị tụnye ndị be anyị azụ etu ha nwere ike isi were gbalarị kpachi kpachi okporoụzọ. Zụta ihe mgbaama, gbaa mbọ hụ na ị tetara ma ọ kụwa Oge ruo ya tiwe mkpu, i bilie n'ụra. Agwala onwe gị ka ịrahụtụkwuo ntakịrị. Ọrụ gbasaa, chere ka kpachi kpachi belata n'okporoụzọ Ya bụrụ na ụloọrụ gị ga-ekwe, chere ka kpachi kpachi ụzọ belata. Ịnọ n'ụlọọrụ mee ihe bara uru ka mma karịa ịnọ n'ụzọ kpọchiri akpọchi. Jiri ụgbọ mmiri were gaa ma laa ọrụ Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na ụgbọ mmiri na-aga ebe dị icheiche. Kpachi kpachi adịghị na mmiri dị ka n'okporoụzọ. Ọ bụrụ na mmiri dị n'ogbe gị, banye ụgbọ mmiri, ma gbaa mbọ hụ na iyi uwe ndụ oge niile. Kwadobe nkwado n'ụgbọala Ọbụrụ na ọ bụ gị na-anya ụgbọala, biko leghara nke a. Kwara ụmụ ngwongwo gị dịka akpụkpọụkwụ, ọla, ntecha, na ihe ndị ọzọ, ị banye n'ụgbọala, i bido mewe ihe ndị a ka i were gaa n'oge. Gaa lee ihe nkiri na sinima dị ụlọọrụ gị nso Ihe sinima bụ ezi ebe i nwere ike igbu oge. Legharia anya, gaa n'ụlọahịa dịgasị n'okirikiri ebe ahụ were anya gị gbaara onwe gị ekeresimesi. Chọrọ ihe nkiri masịrị gị, kiribe ya, ọ ka mma. Hie n'ụlọ enyi gị bi nso n'ụlọọrụ gị Ọbụrụ na ebe i bi dị anya, chọọ enyi gị bi nso, hie na be ya. I nwere ike ịlaghachi ụlọ nke gị na ngwusị izu. Chọta ụlọ n'ebe dị nso ụlọọrụ gị I nwere ike sị na nke a ga adị oke ọnụ mana ị chemie ya echemi, ị hụ na n'ikpeazụ ọ kaara gị mma. Ị ga-echekwa ego gị ma i mee etu a. N'ihe ndi a niile, ihe kachasị mkpa bụ nchekwa gị, gbaa mbọ hụ na ụzọ ọbụla i soro, na ị chekwabara onwe gị nke ọma. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-48142440,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48142440,"Europa League: Arsenal agwala Valencia na 'ogologo abụghị na nwa m etoola', Chelsea lara na nta",Arsenal gosiri ndị Valencia na ọ bụghị egwuregwu ka ha bịara ịgwụ ka ha nabatara ha n'Emirates.,"Goolu abụọ Alexandre Lacazette ji dọkachaa neetị ndị Valencia na nkeji 18 na 25, na nke Pierre-Emerrick Aubameyang gbanyere n'oge ""gbaa ka anyị laa"" na nkeji 90, zuru ịwụnye aja n'ime garị ndị Valencia. Ebe o si ka njọ bụ na ndị Valencia bu ụzọ chọrọ okwu, ka Mouctar Diakhaby ji isi dọrie neetị Petr Cech na nkeji 11. E ji isi tarie neetị Cech Mana Arsenal zuru ha ike n'ahụ, ma gwa ha na ị gaghị abịa n'ụlọ mmadụ kparịa ya. Lacazette ji iwe mmeri atọ e merichara Arsenal n'ime asọmpi atọ ha gbara n'izu ole na ole gara aga, wee chọọ iti Valencia mmọnwụ ma mezuo goolu ya atọ, mana ochee goolu Neto ekweghi. Arsenal ga-agakwuru Valencia n'azụ ụlọ ha n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee a, ebe ha ga-ama ma ha a ga-awụfere. Ọ bụchaghị abalị ndị Chelsea Goolu Luka Jovic nyerela ndị Eintracht Frankfurt na nkeji 23 kpalitere okwu n'asọmpi a, ma tinye ndị Chelsea na gbagharịwa. Mana Pedro gbapụtara ndị Chelsea n'aka oke ifufe gaara efepụ ha, ka ọ gbanyere goolu na nkeji 45. Ka a malitere, ajụjụ onye ọbụla bụ ""gịnị kpatara Maurizio Sarri ji dewe Eden Hazard n'oche ezumiike""? Mana Sarri mechara kwuo na o tinyeghi ya n'oge makana ọ chọrọ ka o zutu ike asọmpi ole ọ gbarala. O mechara tibanye ya na nkeji 61, ka o wepụrụ Willian. N'agbanyeghi na Chelsea emeghi etu ndị na-akwado ha si chọọ n'egwuregwu a, ha metere ihe ọma e ji kpụrụ ha n'ọnụ. Na ha agbajughi goolu etu a chọrọ emeghi ka Chelsea ghara ịbụ otu a na-emeribeghi n'ime egwuregwu 16 ha gbarala n'asọmpi a. Chelsea ga-ele ndị Eintracht Frankfurt ọbịa na Stamford Bridge ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee a. Is ha ọ ga-apụtakwa?" afirika-49916776,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49916776,Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba,"Ndị Igbo tụrụ ilu sị na ""Ọgọ bụ chi onye""","Ya mere anyị ji bido ngụkọ ọgọ ndị Igbo nwere na mba na-eme ha ihu ọma. Akụkọ a ga-egosi ndị aha ha na-ada ụda na mba niile bịara ala Igbo maka ịlụ di maọbụ nwunye. Lee ụfọdụ ndị ọgọ ndị Igbo ji eme ọnụ. David Adeleke (Davido) End of Instagram post, 1 David Adeleke maọbụ Davido bụ onye otiegwu si mba Naịjirịa ude ya n'ede n'ụwa niile. Ọ bụ onye obodo Ede dị na Ọshụn steeti. N'ọnwa sepụtemba afọ a ka ọ gbanyere enyi ya nwaanyị bụ Chioma Leonard mgbaaka alụmdịnanwunye mana ha agbabeghị akwụkwọ. Kerry Washington Kerry Washington na Nnamdi Asomugha Kerry Washington bụ onye obodo Bronx dị na mba Amerịka. Ọ bụ onye ome ihe onyonyo a ma ama na Hollywood nke mba Amerịka. Nke kachasị eji mara ya bụ ""Scandal"" Ọ lụrụ Nnamdi Asọmụgha n'afọ 2013. Ha ji ụmụ abụọ Rotimi Akeredolu Rotimi Akeredolu bụ otu n'ime ndị ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bụ SAN n'aha ịchafụ. A mụrụ Akeredolu n'obodo Ese Odo dị na Ondo steeti. Ọ lụrụ nwunye ya bu Betty Anyanwu-Akeredolu n'afọ 1990. Ha ji ụmụ anọ. Fani Kayode Femi Fani Kayode maọbụ FFK dịka aha a na-etu ya bụ onye Ile-Ife Oshụn steeti amụrụ na Legọs. Ọ bụ onye ọkaiwu na onye ọma mbem rụburu Naịjirịa ọrụ dịka Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2006 rue afọ 2007. Ọ lụrụ Precious Chikwendu n'afọ 2014. Ha ji ụmụ nwoke anọ. Paul Adefarasin Paul Adefarasin bụ onye obodo Ijebu ode na steeti Ogun nke Naịjirịa. Adefarasin bụ ụkọchukwu ụlọụka ""House on the Rock"" nke ọ wụlitere n'afọ 1994. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ifeanyi Paul Adefarasin n'afọ 1995. Ha ji ụmụ atọ Ibrahim Badamosi Babangida Ibrahim Babangida na nwunye ya nakwa Okparaeze Charles na Lady Diana bụbu nwunye ya Ibrahim Badamosi Babaginda bụ onye obodo Minna dị na Naịja steeti. Ọ bụ ọchịagha chịrị ala Naịjirịa site n'afọ 1985 rue afọ 1993. Ọ lụrụ Maryam King Okogwu n'afọ 1969. Ha mụrụ ụmụ anọ mana Maryam nwụrụ n'afọ 2009. Ivara Esege Ivara Esege bụ di ọdeeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie. Esege bụ onye si mba atọ bụ Naịjirịa, Briten nakwa Amerịka Ọ bụ dọkịta Bekee na'obodo Maryland na mba Amerịka bụ ebe ya na ezinaụlọ ya bi. Ọ lụrụ Chimamanda Adichie n'afọ 2009, ha mụta otu nwata nwaanyị. O nwere ndị ọzọ ị chere kwesiri ịnọ ebe a? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" media-45028232,https://www.bbc.com/igbo/media-45028232,Asaba 2018: Ndị egwuregwu tọrọ n'ọdọụgbọelu Legos eruola Asaba,Ọtụtụ n'ime ndị otu egwuregwu dị iche iche ndị larụrụ n'ọdọụgbọelu nke Legos n'abalị ụnyaahụ ruo ụtụtụ taa dịka ha na-aga asọmpi nke na-eme ugbua n'Asaba abataala Asaba.,"Otụtụ n'ime ndị a jiri ụbọchị atọ larụ na ọdọụgbọelu na Legos Onye ntaakụkọ BBC bụ Janine Anthony nọ n'Asaba kwuru na ha fedatara n'Asaba n'elekere ole na ole gara aga. Cheta na akụkọ pụtara n'ụtụtụ a kwuru na ndị otu egwuregwu bịara Naịjiria maka asọmpị Africa Senior Atletics Championships na Bekee ka tọrọ na n'ọdọụgbọelu na Legos. Ndị na-ahazi asọmpị a na-akọwa na ihe kachasị enye ha nsogbu bụ na okporoụzọ ụgbọelu ga-efedete pere ezigbo mpe na kwa na ụgbọelu buru ezigbo ibu, ya mere ha na-eji ụgbọelu pere mpe na-ebu ha. BBC Igbo gbara Harrison Ochulor bụ onye onyeọrụ mgbasaozi ngalaba na-achịkọta asọmpi a ajụjụ ọnụ maka ihe mmere ndị jiri tọọ n'ọdọụgbọelu na Legos. Ochulor gwara BBC Igbo na ọ na-ewute ha n'ụdị ihe a mere mana ọ bụghị ihe a kwesiri iji mee ndị ọrụ ya mkparị. Ha na-ebe akwa na uhere adịghị ịkwadebe nke ọma maka asọmpi a N'ọnụ okwu ya: ""Ụdị ihe a bụ ihe na-eme ebe niile. Ndị Bekee kpọrọ ya 'logistical challenges.' Ọ bụghị ihe ọhụrụ"" O kwukwara na kama ịkwa ha emo, ndị mmadụ kwesiri ịkụrụ Asaba aka maka nnabata ha nabatara ndị otu egwuregwu a nakwa nchịkọta a chịkọtara asọmpi a. Janine Anthony zitere ozi ụnyaahụ sị na ihere mere ndị na-ahazị asọmpi a maka na ọtụtụ n'ime ndị a tụrụ ugo nke a kpọrọ 'Hall of Fame' na Bekee, anọghị na ya bụ mmemme maka na ha ka tọrọ n'ọdọụgbọelu na Legos. Ihe ndị mmadụ dere na Twitter Mmadụ dịka @UsherKomugisha kọwara n'elu Twitter na ndị otu egwuregwu karịrị 300 tọrọ n'odọ ụgbọelu Ọ bụ @magayijim bụ onye sere foto a mana Katami Michelle bụ onye ntaakụkọ egwuregwu dere na ya na-ahụ otu sị ala Kenya, Burundi, Eritea na Burkina Faso n'ime ndị tọrọ n'ebe a. Akụkọ kwuru na otu dịka otu ala Kenya na-ekwusi ike na ha ga-alaghachị azụ ma ọ bụrụ na onweghị ụgbọala ga-ebu ha gawa Asaba. Foto ka nku Lee ihe nkiri gosi ebe ha tọrọ Asọmpị a ga-ebido taa n'ime ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba taa ruo ụbọchị ise n'ọnwa Ọgọstụ a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46278818,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46278818,Chizoba Rudeboy: Ihe mere m ji gụọ egwu a - Paul Okoye,"""Chizoba, Chizoba, Chizobaaaa"" Paul Okoye - bụ onye eji Rudeboy mara - si etu a kwe ukwe egwu ọhụrụ ya.","Chizobia Rudeboy: Ihe mere m jiri ti egwu a - Paul Okoye Maazi Okoye bụbụ onye nke abuọ n'ime PSquare, bụ aha otu egwu ya na ejima ha hibere. Egwu ọhụrụ ya na-ewu ugbua na soshal media na ndị mmadụ na-eche ihe mere oji na-arịọ chukwu ka udo laghachị azụ n'ime ya bụ egwu. Egwu a pụtara n'elu soshal media ụnyaahụ bụ Nọvemba 19. Ka egwu a pụtara, ndị mmadụ bidoro na-ekwu na ọ bụ maka esemokwu dị n'etiti Maazi Okoye na ejima ya ka ọ ji agu egwu. @OnyecheE rịorịọ Maazi Okoye n'akara Twitter na oge eruola ejima a ga-anabata onwe ha n'udo. Mana n'uche @ItzArinze oge eruola Paul chefuru ihe niile gbasara ya na PSquare. O kwuru na ihe kachasị mkpa ugbua bụ ka egwu ya n'eto ebe ọbụla. BBC gbara mbọ ịga nụta n'ọnụ onye ji mma na ji na akuko a bụ Paul Okoye, maka okwu na-aka mma n'ọnụ onye nwe ya. Maazi kwuru na akụkọ ọbụla di n'okwu a kwesiri ịtụgolo n'elu na ya bụ onye, nke pụtara na ya nwereike ịti egwu maka ihe ọbụla. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya gụrụ egwu a kemgbe otu afọ gara aga, mana ọ bụ ugbua ka o weputara ya. Maazi Okoye kwusiri ike na ọgaghị ekwe ka ihe ndị mmadụ na-eche maka ya maọbụ ezinaụlọ ya mee ya kwụsị ịbụ egwu ọbụla batara ya n'obi. Okoye sị kwuru: ""A bụ m onye egwu, e tiri m egwu a makana a chọrụ m ịkpalite mmụ ndị mmadụ ọbụghị maka ihe ọzọ ndị mmadụ na-eche"". Ọ gakwara n'ihu si ka onye ọbụla nwere egwu kesaa ndi ezinaụlọ maka ezigbote ozi dị n'ime ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45109777,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109777,Etu Mmadụ 12 siri laa mmụọ n'aka ndị oji egbe ezu gara ụlọakụ,Ihe ruru mmadụ iri na abụọ gụnyere onye uweojii nwụrụ na mgbede ụnyaahụ oge ndị oji egbe ezu wakporo ụlọakụ dị n'Igarra n'okpuru ọchịchị Akoko-Edo ma chọọ izu ụfọdụ ụlọakụ ebe ahụ ohi.,"Ndị uweojii anọ nwụrụ na mwakpo a Ụfọdụ ndị uweojii nwuchiri n'ụtụtụ ụnyaahụ so na ndị e gbagburu na mkpa mkpa ahụ. Akụkọ kwuru na ndị oji egbe ezu ahụ buru ụzọ wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii nọ na nso ụlọakụ ndị ahụ iji kwụsị mmekpa ọbụla ndị uweojii nwereike inye ha. Dịka ha na-eme ihe ahụ, ha gbara ụgbọala onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ ọkụ ebe ha gburu mmadụ atọ ndị ọzọ nọ n'akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ. Ha gbukwara ihe ruru mmadụ anọ ọzọ n'ime ụlọakụ ahụ ebe ha na-ewe iwe na ha enweghi ike imepe igbe ego ndị ụlọakụ ahụ. Otu onye hụrụ ihe mere kwuru na ndị uweojii nọ n'ụlọakụ ahụ gbalịrị ịkwụsị ndị oji egbe ezuu ahụ mana ha karịrị ha ike nke butere ọnwụ otu onye a na-amaghị onye ọ bụ. O kwuru na onye ọzọ nwetakwara onwe n'ime agha egbe ahụ bụ onye nwereike inyere ndị uweojii aka na nyocha ha. Onye kwadoro akụkọ a bụ onye nkwuchiteọnụ ụlọ Eze Otaru nke Igarra bụ Folorunsho Dania kwuru na mmadụ 10 bụ ndị nwụrụ n'ihe niile ma kwuo na ọ bụ ihe siri ike. BBC Igbo gbara mbọ inweta onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii bụ Chidi Nwabuzor mana ọ zaghị. Ụdị mkpamkpa a dị ka nke mere na Kwara steeti n'ọnwa Epureel 2018. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45524165,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45524165,"Davido: ""A chọrọm i tinye uche n'ofufe ala nna m""","Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia maka njem ""US TOUR"" Davido gbubiri ife a","@precious_Ugorji kwuru na ọ bu maka i so mee nkwado ntuliaka 2019 ka Davido ji lọtawa. End of Twitter post, 1 @DareAdedayo kwuru na ọ bụ maka ị kwado nwanne nna ya bụ Mazi Adeleke n'izọ ọchịchị. Mana o nwere ndị kwenyere na ya bụ nkwụsị njem. @JojoshuaAgbo kwuru na ọ bụru ezie na Davido kwusiri njem a maka NYSC, na o gosiri na ọ ma uru akwụkwọ bara. @monakanwachi kwuru na ihe kachasi mkpa bụ na ọ batala itinye uche n'ife ala nna ya. Cheta na akụkọ kwuburu na onye otiegwu ama ama bụ Davido e gbubirila njem ya itiegwu na mba US maka i tinye uche n'ofufe ala nna ya. Ndị otu ya na NYSC bụ ""Batch B"" ga-ebi ofufe alanna n'ọnwa September iri na asaa. NYSC bụ emume onye ọ bụla gụchara mahadum ga-emeriri tupu ha nweta ọrụ. Davido gụchara akwụkwọ na Mahadum Babcock n'afọ 2015. Ka o debachara aha n'akwụkw o ime NYSC n'ọnwa Ọgọstụ ụbọchị iri abụọ n'itoolu, onye otigwu a hapụrụ ebe a na-eme nkwado ofufe ala nna gawa njem i ti egwu na mba U.S. Davido na Wizkid bụ ndị aha ha na-ewu ewu ugbua n'agbara ọfụ N'okwu ya, ""N'ihi etu esi hazie emume NYSC nke dịkọtara ọnụ n'ụbọchị m na-etiegwu na mba U.S., a gaghị m emechanwụ njem otiegwu a."" ''Anyi ga-akwụghachị onye ọ bụla ego ya ma ha bịa ị goro akwụkwọ eji elele ya bụ egwu, Davido na ndị otu ya na-agba mbọ ị hụ na ya bụ emume ga-abia na mmezu n'oge na-adịghị anya."" ""A hụrụ m ụnụ n'anya nakwa. M ga-ahụ ụnụ n'oge na adịghị anya."" ""Bikonụ ndị ihe m na amasị, iwe ewela ụnụ makana anyi ga-eyigharị ya bụ njem. Dalu nụ ndị nke kwadoro anyi mgbe anyị bịara obodo ha na Mba U.S."" BBC Igbo gbara mbọ ị nweta ndị ọrụ NYSC ka ha chọpụta ma ha akwadọrọ ya bụ njem na mbụ mere ha ya bụ nwaadị jị bịe ya bụ abịa n'ike. Osote onyeisi NYSC na Lagos bụ Belinda Faniyi azaghị ekwenti ya. Anyị ka ga na-akpọ ha ka anyị nweta ọsisa ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44977602,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44977602,Lunar Eclipse: Ihe onye amụmwa kwụrụ maka ọchịchịrị ikpuchi ọnwa,"Otu ụkọchụkwụ a mara dịka 'Pastọ Abel' ekwuola na maka ọchịchịrị ikpuchi ọnwa bụ ihe ahịma, ihe nke mụọ nke Chukwu ma maka ya.","Ihe onye amụmwa kwụrụ maka 'Lunar Eclipse' Pastọ Abel, onye nke kwuru nke a oge ya na onye ntaakụkọ BBC nwere mkparịtaụka kwuru na o nweghị nsogbu ọbụla maọbụ ọrịa ọ ga-ebute. Ọ gara n'ihu kwuo na ụdị ya bụ ihe ahịma emebuola n'afọ 1947. Ọkammụta Augustine Ubachukwu bụ onyeisi ""Astronomy and Astrophysics Research Group"" na mahadum Nsukka (UNN), kwuru na ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa (ihe Bekee kpọrọ 'lunar eclipse') ruo otu elekere n'abalị taa. N'akwụkwọ ozi Ubachukwu binyere aka, o kwuru sị ""Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa na Naịjirịa na Fraịde, Julaị 27, ma ihuigwe dị mma. A ga-ahụ ya site mgbe ọ ga-eji ọkara gafee elekere itoolu ruo mgbe ọ ga-eji nkeji 20 gafee elekere 11. ""Ndị nọ na mpaghara ""Eastern Hemisphere"" nke mbaụwa nke bụ Yurop, Afrịka, Eshịa, Ọstralia nakwa Niu Ziland, ga-ahụkwa ya. ""Ọ ga-abụ nke kacha ogologo nke anya hụrụla n'ime narị afọ a (century) maka na ọ ga-anọzu otu elekere na nkeji 43. Ọ ga-eji ọchịchịrị na-ekpuchighị kpam kpam bido n'elekere 7:24pm, ebe nke ga-ekpuchi kpamkpam ga-ebido n'elekere 8:30pm ma bie n'elekere 10:13pm. ""Mkpuchi ọnwa nke kacha elu ga-eme n'elekere 9:22pm, mana nke na-ekpuchighị kpamkpam ga-ebi n'elekere 11:19 nke abalị."" Ubachukwu kwuru na ụfọdụ mpaghara Saụt Amerịka ga-ahụ ebe ngwụcha mkpuchi ọnwa a ma anwụ daa taa, ebe ndị Niu Ziland ga-ahụ mbido mkpuchi ọnwa tupu anwụ amalite echi. Ọchịchịrị a ga-eme makana ọnwa ga-anọchi ụzọ anwụ si ahụ ọnwa O kwukwara na ọchịchịrị ikpuchi ọnwa na-eme naanị ụbọchị ọnwa juru eju, ma kwuo na kama ikpuchi anya etu e si eme ma ọ bụrụ mgbe anwụ kpuchiri ọnwa, na a ga-elenwu nke a anya na-enweghị ihe mmerụ ahụ ọbụla. O kwukwara na mkpuchi ọnwa ọzọ a ga-ahụ anya na Naịjirịa ga-eme n'ụbọchị 21 nke ọnwa Jenụwarị nke 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54680552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54680552,End SARS: 'Ndị omekome kụrụsiri ụlọ oriri m na ngaghariwe End SARS mana ọ kwụrụla ugbua',"Ka BBC Igbo gosichara ka esi wakpoo ụlọ oriri Obum Okemuo n'oge e mere ngaghariwe End SARS, Obum arụgharịala usekwu ya.","Obum gwara BBC Igbo na o nwetara enyemaka n'aka ụfọdụ ọyị ya nụrụ ma kirie ihe mberede mere ụlọ oriri ya. O kwuru na o ji otu izu ụka we rụgharịa ebe ahụ ma mepe ya n'otu izu ụka ahụ kwa. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọrụchabeghị ihe niile o kwesiri ịrụ mana o jigodu ego ndị batara ya aka nakwa ego nke ya mezuo ma malitegodu ulọ ọriri ya ọzọ. Lee ụfọdụ foto etu nrụgharị usekwu ahụ si gaa. O jizi igwe wee gbaa glassi ndị omekome kụwasiri na mbụ okirikiri. Obum na ụfọdụ ndị biara ikwado mmepe ụlọ oriri ya. Cheta na Obum Okemuo bụ onye azụmaahịa mepere ụlọ oriri na ngoli n'ọnwa Julai, 2020. Ka o ruru n'ụbọchị October 2020, ndị omekome weghara ngaghariwe SARS banye n'ụlọ oriri ya ahụ wee tiwasa ụzọ nkụwa ya ma bụkọrọ ihe niile o ji hazi ụlọ oriri ya. Okemuo kwuru na ha bụkọrọ njuoyi ukwu 7, njuoyi 5, ntuoyi ya niile , ite 25, ihe niile dị mkpa di n'ime igwe na-enye ọkụ. O kwuru na ugbua ụmụ ọrụ ya 19 enweghịzị ọrụ. Gere ya n'uju ka ịmata ihe ndị ọzọ o kwuru maka nwakpo a." afirika-43781293,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43781293,Buhari na Trump ga-enwe mkparita ụka n'ụbọchị iri atọ nke Epreelụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Buhari na Trump ga-enwe nzụkọ,"White House edepụtala akwụkwọ na-ekwu na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute ogbo ya nke Naịjiria bụ Muhammadu Buhari n'ụbọchị iri atọ nke epreelu. Ọganiru, nchekwa, ịlụso ndị na-eyi ndụ egwu agha n'ezi ọchịchị so n'ihe ndị ha ga-akpa na nzụkọ ahụ. Sọsọ onyeohi ga-achịnwu Naịjiria - Musa Gọvanọ chịburu Kaduna steeti bu Balarabe Musa ekwuola n'onweghi onye ọbụla ga-abanye ọkwa onyeisiala Naịjiría na abụghị onyeohi maọbụ nwe nkwado ndịohi. Ọ sị na ọ hiara ahụ ịchọta ego eji akwado ịzọ ọchịchị na-amaghị ụfọdụ ndị na-ezu ohi ga-akwado gi. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ghana na-akwado ịkwụ ụgwọ ha ji Naịjiria Gọọmentị mba Gbana ekwuola na ha na-ahazi atụmatụ ibido ịkwụghachi ego rụrụ nde otu narị dọla bụ ụgwọ ha ji Naịjiria maka mmanụ agbidi e nyere ha n'afọ ndị gara aga. Ego ha ji Naijiria ruru nde narị dọla na iri isii n'ọnụọgụgụ. N'egwuregwu Rangers awụọla onwe ha n'ala dịka ha enyeghị ọkpụ goolụ ọbụla n'asọmpị NPFL na Kwara United nwere ụbọchị ụka. Ha nọ n'ọkwa asaa ugbua na NPFL. Nkeji ụtụtụ a: Gere akụkọ nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ụmụ Igbo na-agba mbọ na Ladipo, Legos. Gear technican advises Igbo to pay attention to handwork." afirika-48539355,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48539355,Abia Teachers Strike: Ndị nkuzi Abia Steeti ha ka nọ n'abụbụọrụ?,Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị nke Abia Steeti gbara abụbụọrụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa.,"Ndị nkuzi praịmarị sị ka akwụghị ha ụgwọ a kpọrọ 'Teacher Salary Subsidy' ebe ndị nke sekọndịrị na-achọ ụgwọ ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ. Governorship election: Anyị akwụchala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu Akụkọ kwuru na ndị nkuzi a na gọọmentị nwere mkparịta ụka n'izuụka a bụ mgbe a rịọrọ ha kagbuo abụbụọrụ ahụ. Mana n'ụbọchị Monde bụ abalị atọ nke ọnwa Juun, ndị nkuzi agaghị ụlọakwụkwọ. Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ n'Abia Steeti bụ Uchenna Obigwe kọwaara BBC Igbo mpụtara mkparịta ụka ha na gọọmentị Abia State. Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ n'Abia Steeti bụ Uchenna Obigwe O kwuru na gọọmentị kwetere na ha mere ihe ọjọọ site n'iji ndị nkuzi ụgwọ rue ọnwa iri ma kwee nkwa iji nwaayọọ kwụcha ụgwọ ndị a. Ọ sị na gọọmentị wepụtara ego dị otu ijeri na ọma ise iji kwụọ ndị nkuzi ụgwọ ọnwa Ọgọstụ, Seputemba na Nọvemba afọ 2018. Obigwe kwuru na gọomentị sị na ha ga na-akwụ ụgwọ ọnwa abụọ n'ime otu ọnwa nke ga-amalite na ngwụcha ọnwa Juun iji kwụchapụ ụgwọ ndị fọrọ afọ. Obigwe sị na ọ bụ nkwekọrịta a ka gọọmentị na ndị nkuzi nwere rue ugbua, na onweghi mgbe ndị nkuzi ji sị na ha ekweghi. Ọ rụtụrụ aka na ihe nwereike ime ka ọ dị ka ndị nkuzi ebidobeghi ọrụ bụ na ndị isi ha ezibeghi ha ozi banyere nkwerikọta a. Ka ọ dị ugbua, ụlọ akwụkwọ ka gbachichara agbachi n'Abịa steeti, dịka onye nkuzi BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ sị na ha enwetebeghị ozi ka na lagachi ọrụ. Onye bụbụ Kọmisọna mgbasa ozi na steeti ahụ bu John Okeiyi gwara BBC Igbo na ya amaghị nke na-eme na gọọmentị ugbua dịka ya anọghịzị n'ọkwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 52525299,https://www.bbc.com/igbo/52525299,Coronavirus Lockdown: Ihe anya m hụrụ na 'Lockdown' a,Ọ bụ na ụbọchị 27 nke ọnwa Febụwarị ka ebenebe gburu na Naịjirịa dịka a chọpụtara onye mbụ ọrịa Coronavirus n'ala a.,"Mana o ruchara ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị tupu gọọmentị etiti etinye iwu ""nọrọ n'ụlọ"" na Legọs, Abuja nakwa Ogun steeti. Ọ bụghị kwa mmadụ niile nwere ohere ịru ebe ezinaụlọ ha maọbụ ndị enyi ha nọ tupu ọnọdụ a ruru afọ ano e were malite. BBC Igbo chọtara ụfọdụ ndị a, lee ihe ha kọọrọ anyị ebe a: Uzodimma Okonkwo, dị afọ 32. Uzodimma na-arụ ọrụ Bekee na-enyere ndị mmadu aka anata ego enyemaka n'aka ngalaba enyemaka dị icheiche. O kwuru na tupu ebido ""lockdown"", ọ na-agba bọọlụ kwa ngwụcha izuụka, ọ na-agakwa na bee nwanne ya nwoke maọbụ ga leta ụmụnwanne ya ndị ọzọ. ""Lockdown a nyere m ohere ị si nri, gụọ akwụkwọ ma nye kwa m ohere ị si n'ụlọ rụọ ọrụ"" ka Uzodimma gwara onye ntaakụkọ anyị ""Mana ọ metụtakwara akpaego m n'ihi ego m mefuru n'elu nri, ""data"" m ji arụ ọrụ nakwa ụgwọ ọkụ latrik"". Ihe Uzodimma kachasị a tụ anya ma ọrịa Covid-19 laa bụ ""ị gbaa bọọlụ!, nakwa ịhụ etu akụnaụba mba dị icheiche ga-esi gbakee n'ọdachi ọrịa a."" Eyitayo Unini Abijogun, dị afọ 27 Eyitayo na-arụ ọrụ dịka ""Customer Support Executive"" ma nwe kwa obere ahịa ọ na-azụ n'akụkụ na-ewetere ya obere ego. Tupu ""Lockdown"" amalite, o kwuru na ya na ndị enyi ya na-apụ apụ kwa ngwụcha izuụka iji nwete onwe ha maọbụ ọ gaa mmemme dị icheiche. ""Ihe m hụrụ na Lockdown a juru m anya, ụfọdụ ụbọchị ebere m akwa n'ihi na egwu na-atụ m na m nọ sọsọ onwe m"" ka Eyitayo kwuru. ""Akụkọ coronavirus nakwa arahụghị ụra ọfụma mere ka obi m daa mba mana akwụsịtụrụ m nke a site n'ịkpagharị kwa ụbọchị"" ""Ihe m kachasị a tụ anya na ngwụcha ọrịa a bụ ịhụ ezinaụlọ m, ndị enyi m nakwa ị ga mmemme ọzọ. Oge a akụzierela m ihe ndị dị mkpa na ndụ m"" ka Eyitayo kwuru. Chukwudi Ukonne, dị afọ 27 Chukwudi na-arụ ọrụ ""Creative Digital Strategist"". Tupu ọnọdụ a ebido, ọ na-aga ụlọ photo na eserese, na-aga ụka nakwa nleta ndị enyi ya. ""Mgbe ọnọdụ a bidoro, a chụrụ ụfọdụ ndị ụlọọrụ anyị nke mere na ọrụ ka zi nkụ n'aka m. Enweghizi m ike isi nri, ịmegharị ahụ maọbụ ịri nri."" Mana o kwuru na ọ chọtara onwe ya site n'ịchọta ndị enyi ọhụrụ na Twitter nakwa ịmụ akwụkwọ ọhụrụ ọzọ n'Intanetị. ""Ihe m kachasị atụ anya na ngwụcha ọrịa a bụ ịmakụ ndị mmadụ ọzọ mana a ma m na ọ ga-eto aka tupu ebidokwa nke ahụ ọzọ"" ka Chukwudi kwuru na nwgụcha. Faith Dodeye Bassey, dị afọ 28 Faith bụ nwa ada na-arụ ọrụ nhazi mmemme nke Bekee kpọrọ ""Events Planner"" Ọrụ ya bụ ihe juru ya aka tupu amanye ọnọdụ a; ọbụrụ na ọ naghị agbagharị na-akwado otu mmemme, ịchọta ya ebe a na-eme mme ọzọ. Mana kemgbe lockdown"" bidoro, ọ na-arahụ ụra n'ụbọchị ma mụrụ anya n'abalị. N'ọnụ ya ""ị bi sọsọ m metụtara ahụike ụbụrụ m n'ihi na onweghizi ihe m na-atụ anya n'ụbọchị ọhụrụ na-abịa"". ""O mekwara m, m na-eche echiche mgbe niile n'ihi na o nweghizi ego na-abata m aka n'ihi na ụgwọ ọnwa m na-abịa bu kwa izuụka maọbụ kwa ụbọchi"" ka ọ zara anyị. ""Obodo dị ọcha ebe mmadụ niile nwere ikike ị gagharị ma biri ka o si sọ ha ka m na-atụkarị anya ma ọrịa a gafee kpam kpam."" Deola Adele, dị afọ 27 Deola na-arụ orụ ""Key Account Manager"" ma nwekwaa obere ọrụ n'akụkụ. Deola bụkwa ihe ndị Bekee kpọrọ ""Fashionista"". ""A bụ m mmadụ na-akwado ọfụma tupu m pụọ apụ. Ịhụ kwa ndị enyi m na-amasị kwa m nke ukwuu"" ka o kwuru maka ndụ ya tupu ""lockdown"" ebido. ""Ị ga kwa ụlọoriri dị icheiche, ị ga ụlọ ihe onyonyo nakwa ịpụ apụ enweta onwe m ka na-emekarị na ngwụcha izuụka"" ka ọ kọwara. Deola kwuru na ọnọdụ a emetụtaghị ya n'ụzọ dị njọ nke ukwu. ""Sọọsọ ihe ọ napụrụ m bụ ịga ahịa azụ akwa m na-ere n'ihi na e nwere m otu onye agbatobi m mụ na ya dị na mma m na-aga na be ya"". Deola na-atụ anya ịhụ etu ọrịa si gbanwe ndụ ndị nwere ọrụ Bekee nakwa ndị na-achụ nta ego mgbe ọ ga-ebi kpam kpam. ""A nakwa m atụ anya ịgbanwe ụfọdụ ihe n'ahụike m ma ọrịa a na ihe gbasara ya laa kpam kpam"" ka o kwuru.Ihe ndị a gosiri na ọnọdụ ""lockdown"" nke na-abịa na njedebe nwayọ nwayọ metụtara mmadụ niile n'ụzọ dị icheiche. Gwa anyị ka o si metụta gị nwa n'igwe ozi anyị na Facebook." afirika-46819763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46819763,"2019 Elections: Onye ọbụla rere vootu ya, erela ọdịnihu ya",Akụkọ dị mkpa Onye ọbụla rere vootu ya erela ọdịnịhụ ya .,"Nke a bụ okwu onyeisi ụlọụka katọlịk na Legọs bụ Archbishop Adewale Martins gwara ndị ụlọụka ya. Ọ gwakwara ha sị ha gba mbọ tụnyere onye ga-echekwa ma kpuchie okwuke ha. O ji ohere ahụ gwa ndị mmadụ ha ga nata akwụkwọ ntụlịaka ha bụ ""Voter's card"". Ọzọ, A ga-akpụpụ onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe ị zara ọnụ ya maka ebubo ịkpachi akụnaụba ya. Na mba ofesi, Mmadụ atọ anwụọla dịka ndị ọzọ ruru iri anọ n'asaa merụrụ ahụ mgbemgbawa si n'ụlọ achịcha mara obodo Paris jijiji n'ụtụtụ ụbọchị satọde na mba Frans. N'egwuregwu Aha otu egwuregwu Arsenal nakwa West Ham na-ewu ewu ugbua dịka ha sọkọtara mpị n'ụbọchị satode Otu WestHam ji otu ọkpụ goolu asataghị otu merie Arsenal. Akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Abaribe na arịọ ụloikpe mkpeghari arịọ Onye na-anọchịte Abia saụt na ụlọ omeiwu Naịjirịa bụ Enyinnaya Abaribe agaala ụlọikpe mkpegharị n'Abuja ịrịọ ka akagbuo ikpe enyere ka ya na mmadụ abụọ ọzọ nara Nnamdi Kanu n'akaebe weta nde nari naira ha ji naa ya bụ aka ebe. Abaribe sịkwa ka ụlọikpe ahụ kagbuo aha ya n'ime ndị nara akaebe ahụ. Ọ bụ ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa Janụwarị ka ọkaiwu Binta Nyako nyedebere ka akwụta ya bụ Ego. Ndị uwojii sị na Saraki ekwughi eziokwu Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye-kwuo-uche-ya Ndị uweojii Naịjirịa akatọọla ihe onyeisi ndịomeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki kwuru banyere ọnya ọ sị ndị Uweojii dọọrọ ya na ezinaụlọ ya iji memina ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Jimoh Moshood sị na-onweghi mgbe ndị uweojii ji na-akwado, maọbụ na-echekwa ndị isi aba okpu Saraki sị bịara ọgụ na be ya. Moshood sịkwa na ndị uweojii na-echekwa Saraki ka nọ ọrụ ha. N'ofesi, Statue Liberty so na ebe mechiri, mana onye na achị New York na akọwa na ya ga eji ego steeti ya kụọ ndị mmadụ ụgwọ onwa Mgbachi ụlọọrụ gọọmenti na Amerika abanyela abalị iri abụọ na otu nke mere ya mgbachị nke kachasi nọtee aka kemgbe Amerịka malitere. Mgbachị a sitere na ndọrọndọrọ ndị omeiwu pati na-anọghị n'ọchịchị na onyisiala Donlad Trump na-enwe maka ego ọchọrọ ka eji rụọ mgbidi n'oke Amerịka na Mexico N'asọmpị CAF Campions League Mgbe Lobi Stars and Heartland FC zutere Otu egwuregwu Lobi stars nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu abụọ asatara ọtụ ji mepe njem ha mgbe ha zutere Mamelodi Sundowns nke Saụt Afirịka na ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'Enugwu. Lobi ga-aga Ivory Coast n'ụbọchi nke iri na itoolu nke ọnwa Janụwari ga soro Asec Mimosa sụọ mpị. Gee akụkọ ndị a ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke ụtụtu a: 'Anyị mụzị anya ugbua'" afirika-45384408,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45384408,Ka iri ji Uburu Ohaozara siri kpọtụọ,"Ji bụ eze nri niile di n'ụwa, dịka Ndigbo siri kwekọrịta.","Iri ji ọhụrụ n'Adu Uburu Ya kpatara e jiri wepụtara ya ụbochị pụrụ iche. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo, ụbọchị e ji eri ji ọhụrụ bụ mbido afọ ọhụrụ ha. Otu a ka ọ dị n'Uburu Adu nke dị n'okpuru ọchịchị Ohozara n'Ebonyi steeti. Emume ji ọhụrụ nwere ọtụtụ aha n'Alaigbo. Ndị Uburu n'onwe ha na-akpọ ya 'iri ji ọvụ' nke pụtara 'iri ji ọhụrụ' maọbụ 'Isu Ava'. Ndị ọzọ na-akpọ ya 'ikeji,' 'ịhajiọkụ', 'iwa ji' na ọtụtụ aha ndị ọzo dị iche iche. A na-eme emume iri ji n'Alaigbo kwa afọ site n'ọnswwa Ọgọstụ rue ọnwa Septemba. Oge a bụ mgbe e ji egwuputa ji ọhụrụ n'ala. Ji ohuru Ọ bụkwa oge a ka e ji egwupụta akụkụ n'ụgbọ n'Alaigbo tupu a malite ọrụ ụgbọ ọzọ. E jikwa mgbe dị otu a ezurukwa ike ọrụ n'Alaigbo tụpụ amalịte ọrụ ọzọ. O nweghị onye ma ka ya bụ emume siri bido n'Alaigbo, mana ihe anyị chọpụtara bụ na iri ji nwere ugwu pụrụ iche Ndigbo n'akwanyere ya. Emume na nganga sọ iri ji n'Alaigbo kariri akari nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-esi obodo dị iche iche lọtacha obodo ha maka emume iri ji. Ndị enyi, ọgọ na ikwu na ibe na-abịa soro rie ma ṅụkwa n'oge ahụ. Iri ji ohuru na Adu Uburu Nke ndị Uburu Ado mere mgbe ọnwa Ọgọstụ 20, afọ a Gọvanọ Dave Ụmahị na oriaku ya bịara ebe ahụ, iji gosi ka ya bụ emume si dị mkpa. Gọv. Dave Umahi na ọrịakụ na Isu Ava Uburu N'otu aka ahụ, Ndigbo niile nọ n'ofesi na-emekwa emume iri ji. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo ọ bụ Eze obodo maọbụ Ezemụọ na-aka mgbe eji eri ji n'ime onwa Ọgọstụ rue Septemba. Iri ji ohuru n'Adu Uburu Onye kọọrọ BBC ka esi mee emume iri ji nke afọ a n'ụbụrụ bụ Ojukwu Innocent Ene sịrị n'ụburu, ọ bụ onye ọgụ ava (onye na-agụ afọ) na-aka mgbe oge iri ji ohụrụ ruru. Ọ bụ naanị ndị Ọgwụnta nke dị n'ime Uburu ka ọ bụ ọrụ ha ịgụ ya bụ ava (afọ). ""Ya bụ Ezemou na-eji ohere a kele Chukwu Abịama maka uju nri akọpụtara n'afọ ahụ, ọ kachasị ji"" , dịka Ene siri kwuo. Ọ kwụkwara na ""n'Alaigbo, ji bụ eze nri. Ya kpatara ojiri bụrụ arụ mmadụ itukwu n'elu ji"" agbanyeghị ka ugwu ejina onye ahụ. Ji ochie Ihe ndọhachị azụ dị n'emụme a bụ na ndị ọgbaraọhụrụ na-ahụtazị ememe iri ji dịka emụme arụsi. Mana Ene kwuru na n'ezie emume iri ji enweghị ihe gbasara ya na arụsị. ""Ọ bụ emụme eji ekele Chineke maka ji ọhụrụ nakwa afọ ọhụrụ, ma ị kọtara ya ma ị gotere n'ahịa"". Ọ bụrụ na ekelecha orisaebuluwa maka onyinye a, onye ọbụla amalite iri ji. Igwe Akpandu nke Uburu na-ekpe ekpere maka ji ọhụrụ Gịnị mere ji jiri bụrụ eze nri niile n'Alaigbo? Ji bụ eze nrị nịịle maka onweghị ihe dị na ji na-alaniyi. Esi ọtụtụ ụzọ eri ji. A na-esu ya na mmanụ. Gọv. Dave Umahi na-eri ji mbụ n'afọ A na-ete ya ete, sụkwa ya ka nri onuno. Eji ji eme ụrị n'ofe nke ga-eme ka ofe rọọ arọ. Isu ụtara ji Ya mere eji echị onye kachasị akọ ji na mba echịchị pụrụ iche. N'Ụbụrụ Adọ nakwa ebe ndị ọzọ, a na-etụ onye ahụ Osuji. Onwekwara ndị na-echị onye ahụ Di ji maọbụ Ezeji. N'Ikem, onye kọtara ji gbara mkpị abụọ maọbụ ji ogene dịka ha na-akpọ ya, a na-etu onye ahụ Ezeji. Dịka Ojukwu Ene siri gụpụtara anyị, ihe ndị a bụ ụrụ iri ji baara ndị Igbo. Uru emume iri ji baara ndị Igbo N'abalị ụbọchị a ga-eme emume iri ji, a na-ericha ji ochie nịịle iji nabata ji ọhụrụ. Gọv. Dave Umahi na Oriakụ n'emụme iri ji ndị Uburu Mgbe ahụ ji n'amalitekwa imebi, iji gosi na oge ya agaala. N'ụbụrụ Ado, dika na ebe ndị ọzọ, a na-eji emume dị iche iche anabata ji ọhụrụ. Ọ bụrụ na a gọcha ọfọ ya na ya sọ, nke onye Eze, ma ọ bụ Ezemụọ ga-eme, onye ọbụla amalite iri ji ọhụrụ. Onye ọbụna gọrọ ya bụ ọfọ ga eji mmanu nri erie ya bụ ji ohuru ahụ tupu ndị ọzọ amalite. Ụmụokorobịa bịara iri ji n'Uburu Ezinaụlọ ọbụla ga-eji ihe ha nwere rie ji ọhụrụ. Ụfọdụ na eji ọkụkọ, ebe ndị ọzọ na eji ewu n'ihi na ọ bụ ebe aka ruru nwaanyị ọ tụkwasa di ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52286921,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286921,KCee Limpopo: Etu m si kpọpụta otu nwa okorọbia n'ụbịam,Otiegwu a ma ama bụ Kingsley Chinweike Okonkwo eji Kaycee Limpopo mara akọọrọla BBC Igbo akụko ntị anụbeghi mbụ.,"KC Limpopo Akụkọ ahụ metụtara etu ya na nwanne ya nwoke bụ Emeka Okonkwo maọbụ E-money siri gbanwee ndụ otu okorobịa nọ n'ụbịam. Kaycee bụ onye Uli n'Anambra steeti kọrọ akụkọ ahụ n'uju mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na Facebook. Kaycee kwuru na mgbe o si ọrụ otiegwu ya lọta na mba Amerịka, o zoro onwe ya banye okporụzọ ire ahịa ""recharge card"". Ọ bụ ebe ahụ ka o zutere otu nwoke, onye Ebonyi steeti bụ onye kọọrọ ya etu ya na ezinaụlọ ya si ata ahụhụ. KC gara n'ihu kwuo sị: ""Mgbe o ruru ụbọchị ncheta ọmụmụ E-money, ọ gwara m na Chineke tinyere ya n'obi ịnyere mmadụ aka, m were kọọro ya maka nwoke Ebonyi ahụ, ọ sị m chọta ya."" ""Mgbe m gara ịchọ ya bụ nwoke o were bụrụ na ndị gọọmentị anwụchiela ya maka ịre ihe n'okporoụzọ."" ""Agbapụtara m ya na mmadụ asatọ ndị ọzọ ma kpọrọ ya laa n'ụlọ m bunye ya ụgbọala ọhụrụ nakwa naịra puku narị atọ."" Ọ sị na kemgbe ahụ, nwa okorobịa ahụ agbanweela ndụ ya nke ọma. Ọ kọwara na nwata nwoke ahụ rere ụgbọala ahụ jiri ego ya gbapee ụlọahịa abụọ ebe ọ na-ere akwa ma na-arụkwa ọrụ n'ụlọọrụ ya na E-money nwanne ya nwoke. Kaycee kwuputara obi ụtọ ya maka etu nwa okorobịa ahụ siri gbanwee ndụ ya sị ""ọ bụghị mmadụ niile ị nyere ụdịrị ohere ahụ ga-eji ya mee ihe nwere isi."" O kwukwara na anyammiri gbara ya mgbe nwoke ahụ bịara gwa ya na ọ dịla njikere ịlụ nwaanyị n'ihi na ọ hụrụ mgbanwe enyemaka ya butere na ndụ onye ọzọ. Na ngwụcha, o kwuru na ndụ nwoke ahụ na-akpalite mmuọ ya na nwanne ya nwoke bụ E-money inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka. ""Enyemaka abụghị ihe a na-eme maka otuto ọha mmadụ"" ka o kwuru." mba-uba-44572706,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44572706,Gini mere Izrel ji kpụpụ nwunye Netanyahu ụlọikpe?,Ndị uweojii n'Izrel akpụpụla nwunye onyeisiala ha bụ Sara Netanyahu ulọikpe maka ebubo mpụ na mmerụaka e boro ya.,"Ebubo kwuru na nwunye Netanyahu zuru nrị na esi ebe obi di ya nwere onye osi nri Ebubo a na-ebo nwunye Netanyahu gbasara iji dọla narị puku jiri zuo nrị n'obi onyeisiala Izrel etu o kwesịghị. Nsogbu a Sara Netanyahu nwere bụ otu n'ime nsogbu ezinaụlọ ha na-enwe kemgbe ndị nyocha bidoro itinye anya n'etu ha jiri mefuo ego ọha. Ngalaba na-ahụ maka ikpe n'Izrel kwuru na ọ bụ onye na-ahu maka ikpe ọha na Jerusalem tinyere akwụkwọ gbasara Netanyahu n'ụlọikpe. Ngalaba ahụ kwuru na Sara, dị afọ 60, tụrụ asị mgbe o kwuru na ndị na-esi nrị anọghị n'obi Netanyahu, nke mere o jiri zụọ ""nrị n'akpa ọha"". Ha kwuru na site n'afọ 2010 ruo afọ 2013 Netanyahu, na ndị be ya nakwa ndi ọbịa ha, jiri ""aghụghọ nata nrị narị kwa narị a na-eche ruru dọla otu puku narị."" Nwunye Netanyahu, bụ onye a ma ama dika onye na-akwado di ya kemgbe ọ nọ n'ọchịchị, kwuru na onweghi ihe ekwesighi ekwesi ya mere. Ndị okaiwu ya, n'ime ozi ha zipuru, katọrọ ebubo a, ma kwuo na o bụghị Netanyahu zụrụ nri ndị a, nke ha sị na ụfọdụ n'ime ha bụ nke e nyere ndị ọbịa pụrụiche. Na nkọwa akwụkwọ e ji hazie ebubo a, a zụtara nrị ndị a na-ese okwu n'ụlọnrị aha ha na ada ụda ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50445944,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445944,Fertility in marriage: Lee ka nwoke si asa ụmụ ejima atọ ya ahụ,Maazị Ifeanyi na Patience Akabuogu chọrọ nwa afọ 17 tupu ha amụta nwa.,"Nwunye ya bụ Patience gwara BBC Igbo etu e si gwa ya gbaa n'ezi ka o nwee ike mụta nwa. Mana ọnọdụ ha gbanwere dịka n'otu ntụ ime, ha mụrụ ejima atọ; ụmụnwaanyị abụọ na otu nwa nwoke. Di na nwunye a gwara BBC Igbo ihe ndị ọzọ ha gabigara ka ha na-achọ nwa nakwa etu e si nabata ụmụ ha. Ifeanyi gosikwara etu o si enyere nwunye ya aka ilekọta ụmụ ha. Lee ihe nkiri a ka ị jiri anya gị hụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-57194152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57194152,Chief of Army Staff burial: Etu e si lie Ọchịagha Attahiru Ibrahim na ndị ọzọ nwụrụ na mberede ụgbọelu,E liela ozu Ọchịagha Naịjirịa bụ Attahiru Ibrahim na mmdụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ebe a na-eli ndịagha dị n'Abuja.,"E buuru ozu Ọchịagha Ibrahim na ndị ọzọ n'ekpere alakụba gaa n'ụlọ alakụba nakwa ụlọụka dị n'Abuja maka akwamozu ha tupu e buru ha lie. Onyeisi agha a na mmadụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Kaduna n'ụbọchị Fraịde. E fere ụka akwamozu ndị nke kraịst n'ụlọụka Protestant dị n'Abuja ebe ndị alakụba bụ n'ụlọakakụba dịkwa n'Abuja. Ndịagha nabatara ozu ndịisi ha nwụrụ anwụ n'ụlọụka nakwa n'ụlọalakụba ebe ezinaụlọ n'ọkwa n'ebe ahụ. Lee mgbe a ga-eli Ọchịagha Attahiru Ibrahim na mmadụ isii n'ime ndị nwụrụ na mberede ụgbọelu Ọchịagha I Attahiru bụ onye ji ọkwa 'Chief of Army Staff' Taa bụ Satọde, ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee 2021, ka a ga-eli Ọchịagha Attahiru Ibrahim na mmadụ isii ndị welitere isi nwụrụ na mberede ụgbọelu. N'ozi si n'aka ndịagha Naịjiria, ha kwuru na a ga-eme ekpere akwamozu Attahiru na mmadụ isii ndị ọzọ welitere isi n'ụlọụka National Christian Centre nakwa ụlọAlakụba National Mosque dị n'Abuja. Ozi ahụ kwuru na ekpere a ga-amalite ebe elekere iri nke ụtụtụ, tupu e lie ozu ha mgbe o ji nkeji iri atọ gafee elekere iri na abụọ (12:30) nke ehihie Satọde. A ga-eli ha n'ebe a na-eli ndịagha bụ National Military Cemetery nke dị n'Abuja. Lee aha ndị so Ọchịagha Ibrahim Attahiru nwụọ na ihe Onyeisiala Buhari kwuru Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari akwaala arịrị maka ọnwụ Ọchịagha Ibrahim Attahiru na mmadụ iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ụnyaahụ. Buhari kwuru na mmadụ niile ahụ nwụrụ na ya bụ ihe mberede bụcha dike ndị ""kwụrụ ụgwọ kacha ụgwọ ka udo na nchekwa wee dị n'obodo"". Ọ gakwara n'ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ nakwa ndị agha na ndị Naịjiria aka n'obi, wee sị na ihe mberede a kacha egbu mgbu n'obi dịka o mere mgbe ndị agha na-akwado ịkwụsị ọnọdụ ọjọọ gbasara nchekwa Naịjiria nọ n'ime ya. Buhari nabatakwara ndị isi nchekwa Naịjiria mgbe ha wetere ya ozi ọnwụ Attahiru. Lee aha ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ahụ: Mara na Ọchịagha Attahiru ka werela ọchịchị dịka onyeisi n'ọnwa Jenụwarị na mmadụ iri ndị a si Abuja na-aga njem ọrụ na Kaduna mgbe ụgbọelu ha kpọkasịrị na Kaduna n'ihi 'ajọ ọnọdụ ihu igwe' dịka ndị agha si kwuo. Ọ rụrụ ọrụ na 82 division ndị agha dị n'Enugwu steeti site n'afọ 2015 ruo 2016 tupu e ziga ya ka ọ bụrụ onyeisi ndị na-ebuso Boko Haram agha n'afọ 2017. Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno steeti, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'. Ọ bụ oge Attahiru na-achịkọta ngalaba a ka Boko Haram kpara ọtụtụ mkpamkpa ha kpara n'afọ 2017. N'ọnwa Disemba afọ 2017, e wepụrụ Attahiru dịka onyeisi 'Operation Lafiya Dole' ma zighachi ya n'isi ụlọọrụ ndị agha dị n'Abuja. Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka ihe mberede a: Atiku Abubakar bụbu osoye Onyeisiala Naịjiria ma zọkwaa ọkwa onyeisiala kwuru sị na chi ji ehihie jie n'ihi ọnwụ ndị a. Ahmed Lawan bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu kwuru na ọ bụ ihe mwute. Nasir el-Rufai bụ gọvanọ Kaduna steeti bụ ebe ya bụ ihe mberede mere, tiri ezinaụlọ ndị ihe mberede a metụtara aka n'obi. Oby Ezekwesili bụbu minista agụmakwụkwọ kwuputekwara mwute ya" afirika-43195227,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43195227,Enweghị nkewa dị na Ipob - Emma Powerful,Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere otu chọ ka ekewapụta Biafra site na Naịjirịa akpọrọ Ipob ekwuola na akụkọ kwuru na Ipob ekewaala bụ akụkọ ashị.,"IPOB bidọ nghaghari iwe ya n'afọ 2012 N'akwụkwọ ozi Ipob zipuru ndị nta akụkọ, Powerful kwuru na onweghị onye ọbụla bụ Ezenachukwu Okwudili n'akpọ onwe ya onye isi ọhụrụ otu Ipob. O kwukwara n'obụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche bụ kwa ndị iro ala Igbo chọ ka Ipob nwu ọnwụ n'ike. ""Ihe a chọrọ bụ ka ala Igbo na ndị otu Ipob nwe mgbagwoju anya,"" Powerful dere. Ugbua BBC Igbo ka na chọ ị nweta ndị kpọrọ onwe ha otụ ohurụ nke Ipob ka ha kwuputa ọnụ nke ha. Ihe anyi mara maka Ezenachukwu Okwudili Nnamdi Kanuna Ipobn'ọnụ ọgụ Ipob bidoro n'afọ 2012, ha na-achọ ka ekewa Naịjirịa wee kenye ha mba nke ha akpọrọ Biafra. N'ọnwa Okotoba 2015, ndị agha Naịjirịa nwụchịrị onye isi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu na Lagos. Onweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ ugbua N'ọnwa April nke afọ 2017 ka ụlọikpe ukwu n'Abuja hapụrụ Nnamdị Kanu n'aka Sinetọ Alaribe n'aka mbe. N'ọnwa Septemba afọ 2017 ndị agha bidoro ngagharị ha kpọrọ 'Egwu Eke' wee wakpo be Nnamdi Kanu n'Umuahia. Luo ugbua, onweghị onye mara ebee Nnamdi Kanu nọrọ. N'onwa Septemba afọ 2017, ụlọ ikpe n'Abuja kpebiri n'Ipob bụ otu na-eyi egwu. Ugbua, onweghị ihe gọọmentị kwuru maka otu Ipob a asi pụtara ọhụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada" 44990666,https://www.bbc.com/igbo/44990666,Ị pụtakwara kiri ọnwa ọbara?,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Ụnụ amakwa na ọchịchị kpuchiri ọnwa n'abalị ụnyaahụ? Naịjirịa sonyere mpaghara ndị ọzọ n'ụwa we hụ nwee chinjinabọ kachasị nọtee aka kamgbe afọ otu narị. Ọnwa ọbara na Indoneshia Naịjirịa Osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Ike Ekweremadu ekwuola na mgbochi e gbochiri ụlọ ya ụbọchị ole gara aga bụ nkata iji chutuo ya na onyeisi ya Bukola Saraki n'ọkwa, Ike ịda jụụ otụ nkeji banyere oke ogbugbu na-eme n'ala Naijiria agwụla Ekweremmadụ Nakwa ịkwụsị ndị APC wufere PDP ka ha ghara iwufe. Mana o kwuru na ya agaghị ekwe ka onye ọbụla majaa ya. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ndịgha Naịjirịa ahazigharịala ndịisi Lafiya Dole, bụ atụmatụ ha ji na ebuso Boko Haram agha. Nke bụ ugboro anọ ewepụrụ onyeisi Lafiya Dole n'ime ọnwa iri na anọ, bụ ihe ndị ma maka ya kwuru bụ maka mwakpo ndị Boko Haram na awakpo ndịgha na nso nso a. Akụkọ mba ofesi Facebook abaala na nsogbu Onye nwe Facebook mefukwara ego nke mere o jiri gbatuo n'ọkwa ndị kachasị nwee ego n'ụwa niile Ọ dịka nsogbu gbasara ọkwụ ụgha nke Facebook na-enwe na-emetụtazi ya bụ dike na soshal midia. Nke a bụ maka na ego e ji azụ oke na Facebook jiri pasentị iri na itoolu gbadaa ebe ha mefuru ihe ruru ndị dọla otu narị na iri abụọ. N'akụkọ ndị ọzọ, Egwu Drake na-ebutezi nsogbu na US US akatọọla egwu na-ewu nke Drake kụrụ nke na-eme ka ndị mmadụ wutuo n'ụgbọala na-aga ịgba egwu. Ụlọọrụ njem na US kwuru ka ndị mmadụ kpachara anya maka o nwereike ibute ihe mberede okporoụzọ Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Patience Ozokwor nke mbụ" afirika-46603817,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46603817,Benin Migrants: Ndị gbara ọsọ ndụ na Libya emeela ngagharị udo,Akụkọ dịmkpa Ndị gbara ọsọ ndụ na Lib i a emeela ngagharị udo :,"Ndị gbara ọsọndụ na Libya Ndị gbara ọsọ ndụ na Libyia ejikọla aka ha na ndị gọọmenti Naijirịa were mee ngaghị udo na Bini Ha ji ohere ahụ na-adọ aka na ntị ime ka ndị ntorobịa kwụsị isi ụzọ Libia aga mba ofesi makana uru adịghị na ya bụ isi azụ. Ndị gbara ọsọndụ na Libya Agwara Abigail Lemoh (22) na a ga-enye ya akwụkwọ ikike mba Jamani ma ọ kwụọ puku narị naịra anọ. Abigail Lemoh gbaara afọ 22 Mgbe o ruru Libia, ha nakwa ya otu nde narị naịra, were resị ya onye ọzọ bụ onye goro ya narị naịra puku atọ. Mgbe ọ gbara ọsọ, onye Nigeria ọzo jide ya nawa ya ego ka o were hapụ ya. Kemgbe ọ natara, onwebeghị ọzụzụ ọbụla. Ọnweghị ebe obibi ụgbụa kemgbe ya na nwanne ya nwechere nsogbu. Abel bụ onye Bini Abel so ndị otu a na-akpọ ""Hope for returnees"". O si Edo steeti.Ya na ejima ya so mee njem na Libia. Ejima ya ahụ bụ nwaanyị nwuru n'ọzara n'ụzọ ebe ha ji ọkpa aga Libia. Agụ mmiri gugburu ya n'ụzọ mgbe ha na-eme ya bụ njem. Eliri ya n'uzuzu n'ọzara ebe ahụ mgbe ọnwụrụ. Chioma Onwordi gbara afọ 20 Chioma Onwordi sị Delta steeti. Ọ nọrọ otu afọ na nga Tripoli tupu ndị IOM akpọlata ya. Ọ sị na ụmụnwaanyị 200 na-anọ na otu mkpuru ebe ahụ. Ha anaghị ahụ nrị eri mgbe ụfọdụ. A na-etikwa ha ihe mgbe ụfọdụ. Mba Itali ka o bu n'obi ịga. Boko Hara egbuola otu onye agha Naịjirịa Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria N'aka ọzọ ndị agha ""operation Lafia Dole"" egbuola Boka Haram mmadụ anọ n'ọgbọ ọgụ Maibukarti dị nso Maiduguri. Sani Usman bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwukwara na agha ahụ takwara isi otu onye agha. New Zealand ebidola Referendum Anwụrụ Ike Mba New Zealand ga-enwe referendụm nke ha n'afọ 2020. Ndị mba ahụ chọrọ ịma ma iwu a ga-ahapụ ha ka ha sewe Igbo were na-enweta onwe. Zinedine Zidane N'egwuruegwu, Zinedine Zidane na-ewu na sọshal midia ugbua Ụfọdụ ndị nkwado otu Manchester United na-akpalite okwu ka ọ bụrụ ya ga-anọchị anya Jose Mourinho bụ onye nkuzi ha achụrụ achụ. Gee nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị isi Ohaneze na Afenifere zutere n'Owere ụnyaahụ n'emume Oge Igbo nke Bekee kpọrọ Igbo day Ndị Eze Igbo Nnia Nwodo nọ n'isi ndị Ohaneze gara ya bụ emume, ka Osote onyeisi Afenifere du ndị otu ya bịa. Otu na-elekọta odịmma ndị mba mmiri bụ PANDEF sokwa n'emume Oge Igbo ahụ. Ụlọakwụkwọ mahadum nwereike gbape n'ọnwa Januwari Onye kwuru nke a bụ minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige. Ngige sị na mkparịtaụka ha na ngalaba na ahụ maka ndị nkuzi mahadum bụ Asuu na-aga nke ọma. Cheta na Asuu wụsara ngwa ọrụ kemgbe ọnwa abuọ, nke mere ụmụakwụkwọ jiri nọdụ n'ụlọ. N'ofesi, Ndị na ebuso onwe ha agha na Yemen mebiri iwu etinyere iji kwụsị ọgụ n'obodo Hudaydah. Ndị agha gọọmentị Yemen na ndị otu Houthi kwekọrịtala na ha ga-akwụsị ịkwa mgbọ mana ọgụ ka na-ada ebe ahụ. Agha Yemen atala isi ọtụtụ mmadụ kemgbe obidoro n'afọ 2011. Na egwuregwu, Mba Qatar ekwuola na ha agaghị ikpebi ugbua banyere atụmatụ ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ Fifa wepụtara maka iko mba ụwa nke afọ 2022. Fifa chọrọ ka ewelie ọnụọgụgụ ndị ga-eso n'iko mba ụwa site iri atọ na abụọ ruo iri anọ na asatọ. Gee akụkọ ndị a ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa.; Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa" afirika-51354212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354212,Nigerian Army: Ha bịara na-amaja ndị Afaraukwu Ibeku - Emmanuel Kanu,Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu sị na ọ bụ eziokwu na ndịagha Naịjiria batara n'obodo ha bụ Afaraukwu Ibeku dị n'Umuahia Abia Steeti.,"Ọ gwara BBC Igbo nke a mgbe a kpọrọ n'ekwentị maka kepupu a nụrụ banyere ya. Ọ sị na ha bu ngwaagha dị iche iche bata n'obodo ha n'ehihie ụbọchị ụka ma bido ịmaja ndị mmadụ. Kanu sị na nke a butere oke egwu n'obodo dịka onweghi onye mara ihe ha bịara ime. Ọ sị na ọ bụ ụdị ihe ha mere n'afọ 2017 butere ọnwụ nne na nna ya bụ ndị a na-akwado ili. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Musa Sagir n'ekwentị ịnụta n'ọnụ nke ha mana ọ zaghị. Daniel Amokachi ga-anọchite anya Naịjirịa n'okwu ịgba bọọlụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtala Daniel Amokachi dịka onye ga-anọchiteanya Naịjirịa n'ihe banyere egwuregwu bọọlụ. Ọ ga-enyere mịnịstrị na-ahụ maka egwuregwu na ndị ntoroọbịa aka ịnyopụta ndị na-eme nke ọma n'egwuregwu bọọlụ. Cheta na Amokachi so n'ime ndị Super Eagles mabutere iko mba Afrịka n'afọ 1994 nakwa ọlaedo n'Atlanta Olympics n'afọ 1996. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị Naịjirịa ewpụtala okpụrụ visa ọhụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ndị ya na-arụ ọrụ ụkpụrụ 'visa' Naịjiria. Dịka ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmad si dee na Twitter, ya na ndị na-arụrụ ya ọrụ gụnyere Lai Mohammed bụ minista na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjiria, nọ n'ime nzụkọ ime ụlọ ebe ọ na-egosiputa atụmatụ a. Tolu Ogunlesi bụkwa ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Buhari kọwara etu atụmatụ a si metụta ma ndị chọrọ ịbịa mee ihe dị iche iche na Naịjirịa. 'World Cancer Day' Taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, bụ ụbọchị mbaụwa wepụtara kwa afọ maka ọrịa akpụ a kpọrọ Cancer na Bekee. Ị nyochaala onwe gị? Kwadokwa ndị na-arịa ya nakwa ndị si n'ọrịa a gbakee. Lee akụkọ onye meriri ọrịa a: 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije' Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha ebe ahụ si kwụrụ. Nwa ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha, na ha ""ahụghị gọọmentị anya nke ha ji anụ ọnụ okwu ha"". Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: arap Moi anwụọla Daniel arap Moi chịrị dịka onyeisiala mba Kenya site n'afọ 1978 ruo 2002 Daniel arap Moi bụbu onyeisiala mba Kenya anwụọla n'afọ iri itoolu na ise. Arap Moi rituru n'ọkwa n'afọ 2002 ka ọ chịchara afọ iri abụọ na anọ, nwụrụ n'isi ụtụtụ taa. N'egwuregwu, John Mikel Obi gara Trabzonspor n'ọnwa Julaị afọ 2019 ka o si Middlesbrough gafete Otu egwuregwu Trabzonspor akatọọla ịkpa oke agbụrụ ndị mmadụ kpasoro John Mikel Obi bụbu onye ndu Super Eagles, na soshal midia ka ha zutechara ma merie Fenerbahce n'ụbọchị Satọde. Trabzonspor kwuru na ha emeela mkpesa maka okwu a n'ụlọikpe. A ga-emegharị ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Malawi Lazarus Chakwera (n'aka ekpe) na Saulos Chilima (n'etiti) wetere mkpesa ka e nyochaa mpụtara ntuliaka ahụ kpọpụtara aha Peter Mutharika (n'aka nri) dịka onyeisiala Ụlọikpe dị na mba Malawi enyela iwu ka e megharịa ntuliaka, dịka ọ kagburu mpụtara kpọghachịtara onyeisiala Peter Mutharika n'ọkwa n'ụbọchị 21 nke ọnwa Mee afọ 2019. Ọkaikpe nyere iwu ahụ ka a chọpụtara na mpụtara ntuliaka ahụ agaghị n'anya ya etu o kwesịrị, ma kwuo ka e mee ntuliaka ọzọ n'ime ụbọchị 151. Ụlọikpe ahụ kwukwara na Onyeisiala Mutharika ga-anọkwa n'oche ọchịchị ya ruo mgbe e mere ntuliaka ọzọ. Nke a emeela ya ntuliaka mbụ a ga-agbagha n'ụlọikpe kemgbe Malawi nwetara nwereonwe ha n'afọ 1964. Eduola iyi ọrụ n'Imo steeti Eduola Cosmas Iwu bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti n'oge Ikedi Ohakim n'iyi ọrụ n'otu ọkwa ahụ n'okpuru Hope Uzodinma. E dukwara Cyprian Akaolisa iyi ọrụ dịka Ọkaiwu kachasị na kọmishọna na-ahụ maka ikpe ziri ezi nke steeti ahụ, ma dukwaa Nnamdi Anyaehie iyi ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ nke steeti ahụ. 'Ịza nwunye ka mma' A na-abọkasị Adamu Garba zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa ka ọkụkọ n'elu soshal midia, dịka o kwuru na nwaanyị ịza 'nwunye' ka mkpa karịa ịchị ụlọakụ CBN. Ndị mmadụ akpọkachaala ya ntu maka okwu ya: Cheta na Garba bụkwa onye kwuru na ọ bụ ndụ ndị Amerịka ndị Naịjirịa na-ebi ka e kwesịrị ịta ụta maka etu ụfọdụ ndị Naịjirịa si echefu onwe ha na ebe ha si. Ọnọdụ Neymar Neymar agaghị eso ndị PSG mgbe ha ga-ezute Nantes taa dịka e kwuputara na ọ merụrụ ahụ n'egwuregwu nke satọde. Neymar dị afọ 28 na onwe ya, kpọrọ pati ụbọchị ụka iji mee emume ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: ' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ" afirika-43814819,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43814819,Sinetị: Ihe mere na sinet bụ arụ megide Naijiria,Ụlọomeiwu sinetị ewepụtala akwụkwọ ha jiri tinye ọnụ n'ihe mere ebe ahụ taa.,"Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti N'akwụkwọ ahụ nke onyeisi mgbasaozi na sinetị bụ Aliyu Sabi Abdullahi binyere aka na ya, o kwuru na ihe mere na sinetị taa bụ arụ megide mba Naịjirịa maka na ndị ahụ batara na sinetị chọrọ ichutu otu ngalaba ọchịchị Naịjirịa. N'aka nke ọzọ onyeisi sineti bụ bukola Saraki edeepụtala akwụkwọ ikwu ebumnobi ya gbasara ihe mere taa. O kwuru na obi dị ya ụtọ etu ndị sineti siri na-ekweghi ka mkpamkpa ahụ kwụsị ha ọrụ ha. Content is not available End of Facebook post, 1 Ndị omeiwu ahụ mechara nwee ọgbakọ ha mana ha ejighi ọfọ ahụ na-efu we mee ya. Ndị ụlọomeiwu nta bịara sonyere ndị sinetị taa nwee ọgbakọ maka ya bụ ihe mere nie ha mechara we nye onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris na onyeisi ndị SSS bụ Lawan Daura otu ụbọchị ịchọta ya bụ ọfọ na-efu efu. Ndị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti Nke a na-eme ụbọchị ole ndị sinetị kwuchara ka a chụọ ndị isi ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa. Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola okwu maka ya bụ ihe mere, ndị otu pati Sinetọ Ovie bụ APC akatọla ya bụ mkpamkpa. Ha dere ya n'akara twitter ha taa: N'akụkụ nke ha, otu pati na-anghị n'ọchịchị bụ PDP etinyekwala ọnụ ha n'ihe ahụ mere wee katọọ ya. Site n'ozi ha depụtara n'akara twitter ha, ha gwara ụmụ Naịjirịa ka ha lebaa anya na mwakpo nakwa ahụhụ nke otu pati APC na-ata ndị omeiwu Naịjirịa na ndị isi hanke gunyere ikwu ka ndị uweojii jide onye sịnetọ. BBC Igbo gbara onye ọkaiwu Nwabueze Ugwu ajụjụọnụ gbasara ihe ahụ mere, o kwuru na ihe bụ ihe ihere nye Naịjrịa na iwu Naịjirịa. N'okwu ya; ndị ụlọomeiwu mere nkeọma wee jiri ọfọ ọzọ we mee ọgbakọ maka na iwu Naịjirịa ekwughi na ọ bụrụ na ọfọ adighị, ha agaghị ejili ọfọ ọzọ mee ọgbakọ. Mana o kwuru na ndị gọọmenti etti kwesiri ịhụ ndị isi ọrụ nchekwa niile dịka ndị ụlọomeiwu si kpọọ oku ya ụbọchị gara aga. N'aka nke ọzọ, onye ọnụ na-erụ n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na ndọrọndọrọ bụ Okechukwu Nwoke gwara BBC Igbo na ihe a gosiri na ọchịchị edoghi ndị APC anya. Nwoke kwukawara na ụmụ Naịjirịa na-ele anya ihe ga-eme onye sinetọ ahụ wakporo ụlọomeiwu taa n'ihi na ihe o mere kwesiri itu nga. Akụkọ ga-amasị gị:" 49645030,https://www.bbc.com/igbo/49645030,Nnamdi Kanu na osote ya na-aga ịhụ ndị nnwereọnwe na-amasị na ụlọomeiwu Yurope' - Ipob,Onyeokwu ndị otu Ipob bụ Paul Achalla akọwaala ndị ha na onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanụ ga-ahụ n'European Union n'uhuruchi taa bụ Tuzde.,"Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Achara kọwara na ọgbakọ a abụghị maka ndị European Union niile kama na ọ bụ kọmiti ndị nnwereonwe na-amasị. Ọ kọwaghị ndị otu kọmiti a bụ, kama ọ sị na nke a bụ mbido ọtụtụ ihe otu Ipob kwadoro iji mee ka ọha nụrụ ọlụ ha. Achara kọwara na Nnamdi Kanu ga-akpa ọtụtụ ihe metutara ndị Igbo na mwereonwe ha ya na ndị otu Ipob. O kwukwara na ""mgbe adịghị anya na ndị otu ha ga-ahazị ọgbakọ nke ndị European Union niile ga-eso. Nke a ka bụ njikere"". BBC nwetere ndị na-ahụ mgbasa ozi n'ụlọomeiwu EU ha were si na ha amaghị maka atụmatụ a. Maazị Tilla McAnthony bụ onye ya na BBC Igbo kwuru sị na ya bụ ụlọomeiwu ka malitere ọrụ n'izu ka gara aga. Ọ kwukwara na ya ga-eme nchọpụta ịmata nke bụ eziokwu ma kpọghachị BBC Igbo. Anyị na-eso akụkọ a ka anyị mata nke ga-eme. Ihe nkiri ga-amasị gị: South Africa Killing: Onweghi ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi" afirika-47479352,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47479352,Sandie Okoro: Ihe ị kwesiri ịma maka agbara nwaanyị a,"Kemgbe ụnyaahụ bụ Wenezde, aha Sandie Okoro, ada Igbo na-arụ dịka osote onyeisioche na-ewu na soshal midia dịka ụfọdụ ụmụ Igbo ji ya eme ọnụ.","End of Twitter post, 1 Mana ọ bụ taa ka nwata ahụ wara eze, ọ b ụ n'afọ 2016 ka ụlọakụ ụwa a kpọrọ ""World Bank"" na Bekee mere Sandie Okoro osote onyeisioche n'ụlọọrụ ha n'ihe gbasara ikpe(Senior Vice President & World Bank Group General Counsel.) Sandra Okoro bụ onye ọkaiwu mba Briten na-arụ ọrụ na ụlọakụ HSBC tupu ụlọakụ ụwaniile a họpụta ya dịka osote onye ndu ha. Otu a na-echeta ya dịka otu agbara nwaanyị ndị Igbo Ebe Anny na-ekwu maka Sandie na ụmụ nwaanyị ndị Igbo ọzọ welitere isi Dika a na-ajụ ase gbasara ya, lee ihe isii ịkwesiri ịma maka Sandra Okoro. 1. A mụrụ ya n'ala Bekee - n'obodo Fulham dị na mba Briten 2. Nna Sandra bụ onye Igbo ma bụrụkwa onye nkuzi mana Nne ya abụghị onye Igbo. 3. Ihe gbasara oke ruru ụmụ nwaanyị bụ ihe dị ya oke mkpa. 4. O ritela ụfọdụ ntụrụgo gụnyere nke Middle Temple UK, FTSE Board n'afọ 2016 nakwa Power List nke mba UK. 5. O sonyela n'ọsọ 'London Marathon ugboro abụọ. 6. Ọ na-enye oge ya n'efu n'ịkwado ihe gbasara ụmụakwụkwọ ụmụnwaayị. Ụmụ nwaanyị Igbo ndị ọzọ rụrụ ọrụ na World Bank Obiageli Ezekwesili - Okonjo-Iweala dere akwụkwọ maka mpụ na awaụwọ dị na gọọmentị mgbe ọ nọ ọrụ obodo" afirika-43986558,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43986558,Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ngosi akwa ọrịa n'ụlọikpe,Ụlọikpe abụrụla ebe ngosi etu ndị ndọrọrndọọ ọchịchị ga-esi kwado bịa maka ikpe ha nakwa ụdị akwa ọrịa ha ga-eji bịa.,"Dino si n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ gaa n'ụlọikpe Ọ bụụla ihe ngosi na ụfọdụ ndị ndọrọndọọ ọchịchị a na-ekpe ikpe na Naịjirịa maka mpụ maọbụ mmerụaka na-eji ute ọrịa aga n'ụlọikpe. Ihe ha ji eme ihe a edoghi anya maka na ndị mmadụ ajụọla maọbụ ka ha nweta ebere n'aka ndị mmadụ ka ọbụ ka ha gbanarị ikpe. na ụmụ Naịjiria na-eche ụbọchi ikpe ọbụla ịhụ nke onye ga-eji bịa nke ya. Ndị ji akwa bịa n'ụlọikpe: 1. Dino Melaye Nke dị ụmụ Naịjirịa ọhụụ n'obi ugbua bụ onye na-anọchite anya ndị Kogi west na sineti bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye e bu n'ụgbọala e ji ebu ozu na ndị ọịa gaa Kogi steeti ebe ndị uweojii chọọ ikpọga ya ụlọikpe. Melaye ji akwa ọrịa gaa ụlọikpe ụbọchị Wenezde ebe ọ gara ịnata mgbapụta. Dino si n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ gaa n'ụlọikpe 2. Olisa Metuh Metuh bụbụ onyeisi ngalaba mgbasaozi nke otu pati PDP jiri akwa ọrịa gaa ụlọikpe n'aAbuja n'ọnwa Feburuwarị afọ a bụ 2018. A na-ekpe Metuh maka mpụ na mmerụaka ego ruru nde naịra 400. Ụbọchị o kwesiri igosi onwe ya n'ụlọikpe, e ji ụgbọala e ji ebu ndị ọrịa bute ya n'ụlọikpe ebe ọ nọ n'akwa ọrịa. E buru ya na akwa ọrịa ya bubata nime ụlọikpe ebe ọ nọ ka onye na-adịghị ndụ. Tayor wepụtara foto Metuh oge ebu ya banye n'ụlọikpe nime akwa ọrịa. Ndị ọzọ dara ọrịa oge e bidoro ikpe ha 1. Diezani Allison-Maduekwe Nwaanyị bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka mmanụ agbidi, e boro ya ebobo mpụ na mmerụaka. O jighi akwa gaa ụlọikpe mana ozigbo ikpe ya bidoro, akụkọ akụkọ pụtara na ọ na-arịa kansa. Teliat Kunle dere n'akara twitter ya n'eziokwu mpụ bụ ọrịa. 2. Femi Fani-Kayode A na-ekpebu Kayode onye bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka njem ụgbọelu ikpe gbasara mpụ na ohi ego ruru ijeri dọla anọ n'ụma. Oge a na-eme ikpe Kayode, ọ gwara ndị ụlọikpe na ya nwere ọrịa mkpụrụ obi. 3. Nenadi Usman Nwaanyị a bụbu mịnịsịta okwu ego dị n'aka. E boro ya ebubo mpụ, aghụghọ na ohi na mkpamkpa ya na Kayode na Danjuma Muhammed. Oge e bidoro ikpe ya, ọ gwara ndị ụlọikpe ka ha nye ya ohere ịga ụlọọgwụ na mba ofesi maka na ya nwere kansa. Ndị ụlọikpe nyere ya ohere ahụ ka ọ gaa mba Amerịka maka ọụ̀wụgwọ ya n'afọ 2017. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44963070,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44963070,Codeine: Ndị ọrụ kọstọm akpachiela katọn 498,Ndị ọrụ kọstọm kpachiri kọntena atụbatara atụbata bu ọgwụ ụkwara codeine karịrị katọnụ 498 na Legọs echi gara aga.,"Ngalaba na-ahụ maka mbupu na mbubata ngwaahịa na Naịjirịa a na-akpọ Kọstọm, kwuru na ha kpachiri ụgbọala bu ya bụ ọgwụ n'ụzọ Ijebu-Ode dị n'Ogun steeti. Ha kwuru na ihe karịrị katọnụ 498 ahụ ha kpachiri ruru nde narị abụọ ma e ree ya. Ndị Kọstọm ahụ nke Muhammad Uba Garba bụ onyeisi ha, kwuru na ha nụrụ kepu kepu na ndị ahụ bu ọgwụ ọtọmegbum ahụ abata, chụrụ ha gawa. Ha chukwudoro ha ma nwụchie ma ọkwọụgbọala ma onye nwe ya bụ ụgbọala. Cheta na ndị ọụ BBC gara jiri aka ha mee nyocha ebe ha chọpụtara etu ọgwụ ụkwara nwere codeine si anyụ ndị mmadụ na-aṅụbiga ya oke anya. Lee ihe nkiri gbasara ya ebe a. Codeine, ọtọmegbum Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50499851,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499851,Ọ bụ ndị na-azọ onyeisi ọdọụgbọala bara onwe ha ọgụ n'Ebonyi - Uweojii,Loveth Oda bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ebonyi steeti a katọọla akụkọ kwuru na ndị APC na PDP lụrụ ọgụ n'obodo Agubia dị n'Ikwo.,"Kama na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala dị n'obodo ahụ malitere ịlụ ọgụ n'etiti ha. Ọ gwara BBC Igbo na nke a na-abịa dịka onye jibu ọkwa ahụ gbara arụkwaghịm n'ọrụ, a na-achọzi onye ga-anọchi anya ya. Ya mere onyeisioche okpuruọchịchị Ikwo họpụtara ndị ga-anọchitu ọkwa a nwa oge nta mana ụfọdụ ndị ntoroọbịa jụrụ ma họpụta ndị nke ha. Nke a butere ọ gbaghaara n'etiti ha, ịlụ ọgụ nakwa ịkpọ ụlọ na ụgbọala a ọkụ. Odah sị e merụrụ ọtụtụ ndị ahụ mana o nweghi onye nwụrụ, gbaa ụfọdụ ụgbọala na ụlọ obibi ọkụ. Odah sị dịka ọ dị ugbua na ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị so mee nke a ma weta udo n'obodo ahụ. Mana otu onye a kpọrọ gwara BBC Igbo n'ezie na ọ bụ esemokwu onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala butere nke ahụ. O kwuru na ọ bụ otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ itinye ndị nakwa n'isi ọdọụgbọala ahụ. BBC Igbo gbara mbọ inwete ndị isi otu PDP na APC ịmata uche n'okwu a mana o nwebeghi isi." 47987168,https://www.bbc.com/igbo/47987168,Chelsea VS Slavia Praha: Ọ fọro ntakịrị ka ekwe kụọ n’isi Chelsea,Ọ bụghị obere ihe mere n'azụ ụlọ Chelsea ka e nyechara ọkpụ goolu asaa n'ime otu egwuregwu a.,"Goolu abụọ Pedro nyere n'ime nkeji ise na nkeji 27 nke Olivier Giroud nyere na nkeji 17, na nke Simon Deli nke Slavia Prague ji aka ya gbakpuo n'ime neetị ha zuru ime ka Chelsea chee na ha alaferela. Tomas Soucek nke Slavia gbalịkawara ihicha ndị otu ya ihu ka o nyere goolu na nkeji 25. Mana dịka a banyere n'ime ọkara nke abụọ, Petr Sevcik nke Slavia eburu nsogbu ya bịa sị ha ""teta n'ụra"". Sevcik nyere goolu abụọ n'ime nkeji 51 na 54 iji nye ndị ya olileanya. Mana ""Chi"" ndị Chelsea gbadatara bịa zọpụta ha n'ihe gaara abụ ihere. Chelsea ga-ezute Eintracht Frankfurt n'agba ọkara-ikpeazụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee." afirika-43420821,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43420821,Gọọmentị Enugu ebidola ị rụzi ahịa Timbershade gbara ọkụ,"Ahịa osisi dị na Timbershade Enugwu nke gbara ọkụ ụbọchị ole na ole gara aga, abụrụla nke ọrụ mgbanwe malitere na ya na ike na ike.","Ebidola ọrụ n'ụlọ ahia dị iri asaa na abụọ nke gbara ọkụ BBC Igbo gara na ya bu ọgbọ ahia wee hụ na ofoziri ntakịrị ka a ruchaa ya bu ụlọ ahia dị iri asaa na abụọ nke gbara ọkụ pia pia. Onye isi otu jịkọtara ndị ahịa Timbershade bu Levi Obi, kwuru na ọchịchị ya ga-eji ego ahụ dị nde naira iri na anọ na ụma, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nyere ha wee rụzisia ya bụ ahia. O kwere nkwa na o nweghi onye ọ bụla a ga-emegbu na ya bụ ọrụ. Onye ode akwụkwọ ndị Timbershade Gilbert Nnaji onye ụlọ ahịa ya gbara ọkụ na-ekele gọọmentị Enugu Friday Egbo na Moses Nwangwu kwuru na ha nwere olileanya na gọọmenti ga enye ndị Timbershade igwe na enye ọkụ transformer nke ha, ya na ụgbọala na agbanyụ ọkụ ka ewee chekwaa ọdachia na ọdinihu. Levi Obi kwukwara na gọvanọ Ugwuanyi kwekwara onye ọ bụla ụlọ ahịa ya gbara ọkụ nkwa ị nye ha niile otu nari puku naira na otu otu ka ha were kwanye ngwa ahịa. Ọrụ na-aga ọsọsọ na ya bụ Timbershade, nke na oge na adịghị anya ahịa ga amalite n'uju. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43390144,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43390144,inec agaghị agba akwụkwọ ntuliaka ndị ewereghị ọkụ,Inec si n'ọnụ onye odee akwụkwọ na-enyere onyeisi ngalaba ha aka bụ Rotimi Oyekanmi kwuo n'akụkọ a abughi eziokwu.,Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka Oyekanmi gwara BBC n'elu ekwentị n'onweghị mgbe inec kwadoro ị gba akwụkwọ a na-akpọ ''PVC'' n'olu bekee ọkụ. Ọ sị na-akụkọ a nwereike ị pụta maka na ndị mmadụ aghọtaghị ihe Rufus Akeju bụ onyeisi inec n'Ondo steeti kwuru maka ya bụ PVC Oyekanmi kọwara na inec a gaghị emefụ ego ha tinyere n'ibiputa PVC ndị a kama ha nọ na-enwe mkparịtaụka maka etu ha si ga-ahazị ihe ndị a. Ndị mmadụ ka nọ na-egosi iwe ha n'elu igwe okwu maka ndenye aha hịara ahụ na ntuliaka afọ 2019. Lee ahụmihe otu onye: Ọ kọwara ihe mere ebe ọ gara ị denye aha ya maka ntuliaka afọ 2019 na oge o gburu ebe ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 47987050,https://www.bbc.com/igbo/47987050,House of Assembly: Ụlọikpe enweghi ikike ịchụpụ m n'ọkwa Sịnetọ - Ogbuorji,Ụlọikpe enweghi ik ike ịchụpụ m - Ogbuorji,"Akụkọ ndị dị mkpa taa: Sunny Ogbuorji onye na-anọchite anya Ebonyi South n'ụlọomeiwu asaala okwu ọchụchụ ụlọikpe chụrụ ya dịka onye Sịnetọ. O kwuru na ụlọikpe enweghi ike ịchụpụ ya n'ọkwa Sịneti kama na ọ bụ onyeisi ndị ụlọomeiwu nwere ikikere ime nke a. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gbaala akwụkwọ ikpe mkpegharị n'ụlọikpe 'Appeal' ka ha kwuo ma ikpe a ọ bụ ihe ziri ezi. Ụlọikpe ukwu dị n'Abakaliki nke ọkaikpe Akintola Aluko nọ n'isi ya kwuru na Ogbuorji dara iwu Naịjirịa site n'ịwụpụ na pati ọ nọ nwete ọkwa bụ PDP ma banye APC. Ụlọikpe a gara n'ihu sị ya kwụọ ụgwọ ihe niile oritere n'uru dịka ọ nọ n'ọkwa sịnetọ nke gụnyere ụgwọ ọnwa niile o riri. Ndị kpọpụrụ ya n'ụlọikpe bụ Evo Ogbonna Anegu, Oti Ama Uche, Uche Richard, Una Sunday Okoro na Simon Ajali Ogbadu n'aha ha nakwa nke PDP Ebonyi Steeti. Cheta na Sunny Ogbuorji ji aha pati APC zọọ ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti na ntuliaka afọ 2019. Agwọ achụọla George Weah ọsọ n'obi gọọmentị Liberia N'ihe dịka akụkọ ifo, onyeisiala mba Liberia bụ George Weah agbala ọsọ ụkwụ ete aja n'ụlọọrụ ya dịka a hụchara agwọ ojii abụọ n'obi gọọmentị mba ahụ. Odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Smith Toby gwara BBC na a hụrụ agwọ ojii abụọ n'ụlọrụ ngalaba naz-ahụ maka ihe na-eme na mba dị ọzọ bụ ebe ụlọrụ Weah dị. E nyekwara ozi ka ndị ọrụ niile kwụsị ịbịa ọrụ n'ụlọrụ ahụ rue abalị 21 nke ọnwa Eprelu. Toby kwuru sị na ""nke a bụ iji gba mbọ hụ na eji ọgwụ gbagbuo ihe niile na-akpụ akpụ na ihe na-arịgharị arịgharịa n'ụlọ ahụ."" Toby gbara ama na e gbulighị agwọ abụọ ahụ dịka ha gbakpuru n'ime ọnụ ebe ha siri bata. Toby, onye gara n'ihu kọwaa n'ụlọ ahụ bụ ụlọ ochie kkwuru na Weah ga-alọghachi ụbọchị Monde ma ọ bụrụ na agbacha ọgwụ ________________________________________________________________________________________________________________________ Ụlọụka adaalagbuo mmadụ 13 ụbọchị 'Good Friday' Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Saụt-Afríka bụ Mildred Oliphant na-akwadobụ ịga emume 'Good Friday' n'ụlọụka ahụ Otu ụlọụka adaala na mba Saụt-Afrịka dịka emume Easter na-ebido ma taa isis opekata mpe mmadụ dị 13. ụbọchị Fraide. Ndị ọrụ gbagbata kwuru na e buhara mmadụ i29 n'ụlọgwụ dịka ụlọụka ahụ dara na mpaghara KwaZulu-Natal. Akụkọ kwuru na aja ụlọụka 'Penticostal Holiness Church' dara dịka ha na-ebido emume 'Easter'. Ndị uweojii kwuru na ọ bụ oke mmiri ozuzo zoro na mpaghara ahụ butere ya. ________________________________________________________________________________________________________________________ Nwoke ebepụla onwe ya mkpịsịaka Otu nwoke India ebepụla mkpịsịaka ya n'iwe ka ọ chọpụtara na ya tụnyere pati abụghị uche ya na ntuliaka na-agan'ihu na mba ahụ ugbua. Pawan Kumar,onye tụrụ vootu ya ụbọchị Tọzde tụnyere pati nọ n'ọchịchị bụ Bharatiya Janata Party(BJP) kama ị tụnyere patị Bahujan Samaj Party (BSP),nke ndị agbụrụ ya, ndị Dalit ndị na-ekwu na a na-akpagbu ha na Indịa na-akwado. N'ihe nkiri na-efeghatrị n'ịntanet, Kumar kwuru sịrị, ""Achọrọ m ibinye aka ebe e sere enyi mana binye aka na ebe e sere flawa na amaghị ama."" Akara njirimara pati BJP bụ enyi, ebe nke BSP bụ flawa. ________________________________________________________________________________________________________________________ Praim Minista mba Mali achịsala ọwa Praim Minista mba Mali bụ Soumeylou Boubeye Maiga na ndị ọchịchị ya etinyela akwụkwọ arụkwaghị ụbọchị Tọzde dịka ngagharịiwe sochiri tigbuo zogbuo nke tara isi mmadụ otu nari na iri na mpaghara Mopti dị n'agbata ha na Burkina Faso. Puku kwuru puku ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'abalị ise nke ọnwa Eprelu dịka e gbuchara ihe mmadụ were na-ekwu na gọọmenti emeghị ihe kwesiri ka o me iji kwụsị tigbuo zogbuo ebe ahụ. ________________________________________________________________________________________________________________________ Easter Celebration: Buhari ekelela ndị otu ụka Kraistị Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ezigarala ndị otu ụka Kraist Naijiria ozi ekele dịka emume Easter na- akpụrụ ọkụ n'ọnụ ma kpoo oku ka ha ṅomie agwa Christ site na-egosi ihunaya, umeala na ndidi. Buhari onye kwere nkwa na ọchichị ya ga-akwado ndị ọrụ nchekwa n'ụzọ pụrụ iche iji hụ na nsogbu ntọ,ndị ohi nakwa ndị na-eyi ndụ egwu bịara n'isi njedebe kpọrọ ndị otu Kraist okpu ka ha kpesie ekpere ike ka udo lọghachi n'ala Naijiria. ________________________________________________________________________________________________________________________ Ndị uweojii Enugwu anaghị achị Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Ndị uweojii na Enugwu Steeti ewepụtarala ndị omekome anya ha ji anyụ nsị dika ha hiwere atụmatụ pụrụ iche ha kpọro 'Operation Puff-Adder' na bekee maka ịwa agba ndị ntọ na ndị ojiegbeeezu na-akpa ike steeti ahụ agba ọkachasị n'okporoụzọ Affa Egede, Umulokpa nakwa ụzọ Affa Technical School . ________________________________________________________________________________________________________________________ N'egwuregwu, A kpụla onye nchịkọta otu egwu bọọlụ United Football Club of Nnewi bụ Olisa Onuchukwu, ụlọikpe ukwu nke etiti dị n'Oka Anambara steeti maka iji magomagọ napụ otu ojiegoachụ egọ a kpọrọ Ndubuisi Nwobu ego ruru nde Naira abụọ na ụma bụ ego o kwuru ya ga-eji ezipụ ndị na-eto eto ala bekee maka ịgba bọọlụ." afirika-47382680,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47382680,Presidential Election 2019: 'Ụzọ atọ azịza si zapụ ncheanwụ n'ụzọ oche onyeisiala',Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ekwuola na ọ bụ Muhammadu Buhari bụ onye ga-achị Nigeria n'afọ anọ ga-abịa.,"Mana okwu a ka bụ ihe na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua. Atiku Abubakar bụ onye ya na Buhari zọrọ ọchịchị onyeisiala, kwuru na ya anabataghi ihe Inec kwuru. Ka o sila dị, Immanuel James Ibe-Anyanwu bụ onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere obodo, gwara BBC na n'agbanyeghị na onyeisiala Muhammadu Buhari emeriela, ihe bụ isiokwu ugbua bụ ụzọ o si merie. Lee ihe Ibe-Anyanwu sị mere Buhari jiri merie Atiku: 1) Atiku họtara onye Igbo ka ọ bụrụ osote ya: Ibe-Anyanwu sị na otu ihe mere ka Atiku daa bụ makana onye ọ họtara ka ọ bụrụ osote ya bụ Peter Obi bụ onye Igbo. Ọ sị, ""Ọ bụrụ na ọ bụghị onye Igbo bụ osote ya, Buhari agaghị emerinwu ya."" Nkọwa ya bụ na ọ bụ achọghị ndị Igbo n'ọchịchi mere ndị mmadụ ejighi tinyere Atiku. 2) Ndị mmadụ apụtaghị ịtụ vootu ka o kwesịrị. ""Ndị natara akwụkwọ ntuliaka dị nde iri asaa na abụọ na ụma, mana ndị tụrụ vootu bụ naanị nde iri abụọ na asatọ na ụma,"" Ibe-Anyanwu kwuru. Ma tinyekwa na ya bụ ihe na-agbawa obi dịka ndị Naịjirịa ekwesịghi i na-eme etu a. 3) Ntuliaka a agaghi nke ọma ma: Ibe-Anyanwu sị na ihe ọzọ bụ na ntuliaka a nwere ọtụtụ ọghọm, dịka amaliteghi n'ọge, mpụ na nrụrụaka mere n'ụfọdụ ebe, nakwa ọgbaghara na ogbugbu mmadụ, so n'ihe mere mmeri jiri raa Atiku ahụ. Ibe-Anywanwu gara n'ihu sị na n'agbanyeghi na ndị mmadụ chọrọ ka ntuliaka nke a gaa ọfụma karịa nke 2015, ọ bụghi ihe a ka a hụrụ, n'uche ya. Akụkọ ga-amasị gị" 42775978,https://www.bbc.com/igbo/42775978,'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii',"Mmadụ ole na achota dị m'ọbụ nwụnye na ""social media""? Mmadụ ole na-achọta di m'ọbụ nwunye ma lụ kwa ya n'ime ụbọchị isii?","Sophy Ijọma na di ya Chịdịmma Amedu hụtara onwe ha na Facebook Nke a bụ kwa akụkọ mere eme n'etiti otu nwanyị a na-akpọ Sophy Ijoma na Chidimma Amedụ hụtara onwe ha na Facebook. Ọ bụ mgbe Disemba gbara ụbochị iri atọ n'otu ka Chidimma tinyere ozi o ji achọ nwunye Facebook. Nwa agbọghọ a na-akpọ Sophy zakwara ya ozi a si Chidimma zitere ya ozi ka ha jiri ga iru. Sophy sị na ọ hụrụ dị ya n'anya ozigbo ọ hụrụ ya Chidimma sị na ha kwuru okwu n'ekwenti tupu ya esi Abuja gawa Enugu ị ga hụrụ nwata nwanyị a. Ọ sị kwa na otu ụbọchị ahụ orutere Enugu, ka o nwetara nkwado nke ndi be nwannyi na kwa ndi nke ya maka iga niru ịme omenala ndị ọzọ. ""ije a bidoro dịka egwuregwu maka na ozi m gbasara n'elụ igwe okwu Facebook bụ egwuregwu na mbụ,"" dika Chidimma sị kwuo. Na aka ya, Sophy si na ha bụ ihe turu ya na anya. ""Ọjọ na atụm mgbe anyi gara ịhụ nnem, maka anaghịm ma o ga akwado kam lụọ nwoke m hụrụ na Facebook,"" Sophy gwara anyị. Ezi n'ụlọ ha abụọ nyere ha ngozi na kwado maka mkpebị ha mere ịlụ dị na nwunye" afirika-49686509,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49686509,Chimamanda Adichie: Ihe iri ị kwesịrị ịma maka nwaada Igbo a,"A gụwa ụmụnwanyị Igbo e ji ide akwụkwọ mara, a ga-agunyerịrị Chimamanda Ngozi Adichie.","Ọ ga-ara ahụ inweta nwaafọ Igbo na-anụbeghi maka Adichie. Ọ bụghị sọ na ụbụrụ ya na-acha ọkụ, Adichie bụkwa olu na ada ụda n'ịkwalite ikike ụmụnwanyị. Adichie bụkwa onye ihe gbasara asụsụ na ọdịnala Igbo na-amasị nke ukwuu. Mana ọ dị ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka Ada Igbo a. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: Chimamanda bụ onye odeakwụkwọ a ma ama na mbaụwa 1. Onye ebee ka ọ bụ? A ma na Adichie bụ onye Igbo, mana ọtụtụ amaghị obodo o si. Adichie bụ onye Abba nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambara. Ọtụtụ na-eche na ọ bụ onye Enugwu mana nke ahụ abụghị eziokwu. Kama a mụrụ Adichie na Enugwu. 2. Amụnyere ya n'ime akwụkwọ Nne na nna ya bụ ndị ọrụ na Mahadum Naịjirịa nke dị na Nsụkka. Nna ya bụ James Adichie bụ ọka nkụzi na ngalaba ""Statistics"". Ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ. Ọ bụ ya bụ ọka nkụzi mbụ Naịjiria nwere na ngalaba ""Statistics"". Nne ya bụ nwanyị mbụ toruru n'ọkwa ""Registrar"" na mahadu m Nsukka. 3. Ya na Achebe biri n'otu ụlọ Mgbe Chinua Achebe si n'ụlọ ya dị na Nsụkka kwapụ, ọ bụ nne na nna Chimamanda Adichie kwabara n'ọnụụlọ ahụ. Ebe ahụ ka Adichie na ụmụnne ya nọrọ too. Ijikwa n'aka na ọbụghị ebe ahụ ka ụbụrụ e ji ede akwụkwọ si fee ya? Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob 4. O nwere umunne ise Adichie nwere ụmụnne ise. Ụmụnwoke atọ na ụmụnwanyị abụọ. Ọ bụ ya bụ nke ise n'ime ha isii. 5. O nwere ""A1"" n'Igbo Ọ bụ eziokwu na ihe e ji mara Adichie bụ iji asụsụ Bekee ede akwụkwọ, mana ọ na-edekwa Igbo nke ọma. Adichie nwetara nzere ""A1"" n'asụsụ Igbo n'ule Waec ya. N'eziokwu, Adichie bụ onye nwetara nzere kacha mma n'ule Waec kamgbe e ji bido ụlọakwụkwọ sekọndịrị nke dị na Mahadum Nsukka ruo taa. Onye ma ihe ga-eme echi, ma ọ ga-edepụta otu akwụkwọ n'asụsụ Igbo? 6. Ọ lụọla di? Adichie alụọla di ma mụta otu nwa nwanyị. Aha di ya bụ Ivara Esege, onye Akwa Ibom State. Esege bụ Dibia Bekee nwere agba na mba Amerịka. Onweghị onye ma aha nwa Adichie. Ọ naghị ekwe agwa ndị ntaakụkọ aha nwa ya. Mana e nwere otu mbem Adichie dere nke ọ kpọrọ ""Dear Ijeawele"". Ụfọdụ na-eche na ọbụ aha nwa ya bụ 'Ijeawele' o ji maka ya dee mbem ahụ. Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi 7. Di ya na-asụ Igbo Agbanyeghi na ọbụghị nwaafọ Igbo, Esege di Adichie na-asụ Igbo. Ọ naghị asụcha nke ọma mana ọ na-agbalị. Ọ na-aghọtakwa nke ọma. Ọzọkwa, Adichie kwuru na ya ga-agba mbọ ịhụ na ada ya mụtara asụsụ Igbo tupu ọ mụta Bekee. 8. Ndị ntọ yiri ya egwu N'ọnwa Mee afọ 2015, ndị ntọrị tọọrọ nna Adichie. Nke a mere ka oke egwu tụọ ya n'ihi na nna ya emeela okenye. Ọ nọrọ abalị atọ n'aka ndị ntọrị ahụ tupu ha atọhapụ ya. Mana Adichie na umunne ya bunyere ndị ekperima ahụ ọtụtụ ego tupu ha atọhapụ nna ya. Ụfọdụ akwụkwọ Chimamanda Adichie 9. Adịchie nwere nturuugo nkwanye ugwu ọka nkụ N'ihi ụbụrụ ịchaọkụ ya, nakwa ịdị uchu ya, Adichie enwetala nturuugo dị icheiche. Ndị a abụghị ndị o nwetara maka ịgụ akwụkwọ, kama ha bụ ndị e ji kwanyere ya ugwu. Bekee na-akpọ ya ""Honorary Degree"". Ọmụmaatụ bụ nke Mahadum Duke dị na obodo Durham na North Carolina, mba Amerịka nyere ya. Ndị ọzọkwa kwanyeere Adichie ụdị ugwu ahụ gụnyere Mahadu Amerịka (American University), Mahadum nke Yale, nakwa Mahadum Georgetown. Chimamanda Adichie na Wole Soyinka 10. Gọọmentị etiti nakwa gọọmentị state kwunyeere Adichie ugwu N'afọ 2011, gọọmentị Naịjiria tunyere Adichie ugwu ma nye ya nke a kpọrọ ""Global Ambassador Achievement Award"". E mechaa, n'afọ 2016, gọọmentị Anambara nyekwara ya nturuugo ""Ambassador of Excellence"". Adichie, a mụrụ n'afọ 1977, ga-agba afọ iri anọ na abụọ n'abalị iri na ise nke ọnwa Sepụtemba afọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44934496,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934496,Ndị sineti niile agbakutela Ekweremadu,Onye nkwuchiteọnụ osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ndị ụlọomeiwu sinetị nọ ugbua na be osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu.,"Anichikwu kwuru na ha gara ikwado ya ma gwaa ya na ha kwụsị ike n'azụ ya. Nke a bụ na agbanyeghi ihe mere n'ụlọomeiwu sineti taa. Nke a na gosikwara na ọ bụghị naanị ndị omeiwu otu pati PDP na-akwado Ekweremadu kama ndị otu pati ndị ọzọkwa gụnyere APC. Ndị omeiwu sineti dị mmadị 109, ọ bụrụ na mmadụ 108 nọ na be Ekweremmadu ugbua, ọ pụtara na ha niile nọ na be ya. Cheta na ụlọomeiwu sineti kpebiri taa ka ndị ọrụ nchekwa pụọ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ebe ha wakporo taa. E gbochiri Ekweremadu ịpụta n'ụlọ ya n'ụtụtụ taa, mere ka ọ ghara ịbịa nzukọ ndị ụlọomeiwu ukwu mere taa, ebe ndị omeiwu ruru 14 hapụrụ APC gafee PDP. Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ndị EFCC gbochiri ya ịpụ n'ụlọ ya n'Abuja, na ọ bụghị DSS dịka anyị dere mbụ. @MrBanksOmishore bụ onye enyemaka pụrụiche nke Bukola Saraki, depụtara akwụkwọ ozi ndị EFCC ziteere Ekweremadu n'ụtụtụ a, na Twitter. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, EFCC kwuru na ha chọrọ inyocha Ekweremadu maka ịkpa nkata, mmerụ ikike ọkwa ya nyere ya na ibupu ego nke Bekee kpọrọ 'money laundering'. Ka Saraki banyere n'ụlọomeiwu ma bido 'plenary', o kwutere okwu na Ekweremdu abịanwughị, ma kwuo na-ekwesịrị ịgba mbọ hụ na ọchịchị onyekwuouche ya emebighị. Omeiwu Sam Anyanwu kwuru na ya na Ekweremadu nọ ụnyaahụ, mana onweteghị akwụkwọ gosiri na ndị uweojii na-achọ ya. Ka e mechara 'plenary', ndị omeiwu kpebiri na ndị ọrụ nchekwa kwesịrị ịpụ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ka o nwee ike rite ikike ruru ya. N'ụtụtụ a, Saraki so na ndị egbochiri ịpụ n'ezi ụlọ ya. N'aka ọzọ, onyeisi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kelere ndị siri na APC pụọ taa ka ọ gara ha nke ọma. O kwuru nke a site na akara Twita ya bụ @MBuhari: Ndị EFCC gbochiri ọnụụzọ Ekweremadu n'Abuja Ihe onyoonyo na-egosi ebe ndị EFCC chewere n'ihu ụlọ Ekweremadu: DSS kpọchịrị Ekweremadu n'ụlọ n'isi ụtụtụ ụbọchị 24 Jụlaị n'afọ 2018" afirika-47158577,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47158577,Akụkọ Mike Ejeagha - Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ agha,Mike Ejeagha bụ otiegwu Igbo ama ama n’ihi egwu akụkọ iho ya.,"Egwu e jiri mara ya nke wuru ewu n'afọ 70s na 80s gụnyere ""Ụwa mgbede ka mma"", ""Ọfọ ma onye ji ya"", ""Gwọgwọgwọ Ngwọ"", ""Nwaanyị mma aghara egwu jịta laa"" Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ejeagha kọrọ akụkọ etu ya sị hapụ ọrụ ịkpụ isi, banye iti egwu. Gee ya ihe o kwuru n'uju na nkiri a: Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chris Sanctus Okereke" afirika-47405180,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47405180,Kevin Hart: Lee ka omenka si jiri nka gbanwe ndụ ya,"Eli Waduba, nwa amadi Naijiria Kevin Hart zuru esere o sere na Twitter, ekwuola na 'aka Chukwu dị ya'.","Kevin Hart ekwela nkwa ịzụ eserese Eli Waduba nke Naijiria iji kwalite ya. Waduba, onye na-ese ihe ọ dịka foto, sere Kevin Hart bụ onye ọkpaọchị mba Amerịka a ma ama, were ya tinye na Twitter sị ndị mmadụ kesaa ya na ya chọrọ ka Hart hụ ya ma kwalite ya n'ọrụ nka ya. End of Twitter post, 1 Hart hụrụ ya bụ ozi ma kwe nkwa ịzụ ya nakwa ịkwụ ya ụgwọ ka o sere ya ndị enyị atọ ana anụ aha ha ka. Ugbua ihe mere atụnyere ọkụ na Twitter dịka ọ ghọrọ akụkọ na-ewu ebe niile. Na nkọwa ihe mere,Wadụba ekwuru na ọ bụ aha ya bụ 'Shekwonuwaduba' nke pụtara ""Chukwu na-awara m ụzọ"" na-eso ya. Kemgbe akụkọ ahụ pụtara, ọtụtụ mmadụ na-anụrịrị Waduba. @_valkiing kwuru na ya zipụrụ ozi akpam ọchị maka Buhari na ọ hụghị ya ma ya fọdụ izụ ya. Mana Waduba n'onwe ya gwara ụlọ ntaakụkọ CNN na etu ihe a siri mee bụ ihe tụrụ ya anya. O kwuru na o nwere olileanya na ọ ga-eme mana ọ maghị na ọ ga-eme na nsonso a Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48249139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48249139,Igbo Presidency: Onyeisiala Igbo ga-abụ ọpụrụiche - Nwobodo,Okwu gbasara ndị Igbo ichi Naịjirịa ka na-ekpo ọkụ.,Aka chiburu Anambra steeti bụ Jim Nwobodo kwuru na ihe dị iche ga-adị ma onye Igbo chịa Naịjirịa. Nwobodo rịrọrọ ndị Igbo ka ha jịkọọ aka ma na-ekwusike na ndị Igbo ga-ahọpụtali onyeisiala Naịjirịa na-enweghị esemokwu ọbụla. Ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha gaa n'ihu na-ekpe ikpe kwụ ọtọ makana ọ bụ naanị ha bụ ngalaba na-ejikọ mba Naịjirịa. Nwobodo kwuru nke a n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ iri asaa na itoolu emere n'Enugu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-43819565,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43819565,Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa,"Ndị ntorobịa Naijiria gosiri iwe ha n'ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru n'ọgbakọ Commonwealth e nwere na Westminister, Lọndọn, ụbọchị Wenesde ebe o kwuru na ndị ntorobịa Naijiria adịghị ike ọrụ.","Buhari gara njem ọrụ na London kemgbe izu gara aga Buhari sị: ""Pasentị iri isii n'ime mmadụ dị nde 180 n'ọnụọgụgụ, erubeghị afọ iri atọ ọtụtụ n'ime ha agabeghị akwụkwọ, ha na-ekwu na Naijiria bụ mba na-emepụta mmanụ ya mere na ha ga-etukwuru ala na enweghị ihe ha na-eme, ma na enweta ebe obibi, nleta ahụike na agụmakwụkwọ na-e akwụghị ego ọbụla."" Mana okwu ahụ kpasuru ọtụtụ ndị ntorobịa iwe nke ha kwuputara na soshal midia. Onye na-eme ihe nkiri ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti bụ Yul Edochie, sara onyeisiala na Twitter sị: ""Anyị adịghị umengwụ."" End of Twitter post, 1 Onye ọzọ kpọrọ onwe ya, Maazị Jack Robinson, kwuru na ""dịka onye ntorobia Naijiria gbalahụrụ ọnwụ erughị eru ka a mụrụ ya n'obodo kachasi dị egwu n'ụwa, ebe ụgwọọnwa opekampe a na-akwụ onyeọrụ bụ dọla iri isii ($60), na-enye onwe ya mmiri, na-enye onwe ya ọkụ, na enweghị nchekwa ahụike, ụgwọ ị ga-akwụ ya abụrụ ịgwa mbaụwa na ọ dị umengwụ"". Ebe Jackson Ude kwuru na ọ bụ ihe ihere na onyeisiala Buharị, onye o kwuru na onyenwughị ndị ntọrọbia ọrụ, gwara ọgbakọ Commonwealth na ọtụtụ ndị ntorobịa Naijiria dị umengwụ. Kelly kwuru na ọ dị ezigbo njọ na Buhari kpọrọ ndị ntorobịa ndị ụmengwụ n'ihi na dịka o si kwuo, ndị mba ọzọ maara na ndị ntorobịa Naịjirịa dị ike ọrụ." afirika-44069812,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44069812,'Anyị ji mmiri mmanụ ụgbọala dị esi ihe ma wụọ ahụ',"Ndị bi n'obodo Akoka dị na Legọs na-ebo ọdọ mmanụ ugboala akpọrọ Total, ebubo na ha tinyere ndụ ha na nsogbu.","""We dey baff wit fuel water"" Ndị bi n'obodo ahụ gwara BBC na mmanụ ụgbọala si n'udu Total liri n'ime ala ehipụ abanye na mmiri ha. Ha sị na ọ bụ mmiri a ka ha ji esi nri ma saa ahụ. Ndị BBC gbara Aleem Maruf bụ onye na-ahụ maka ọdọ mmanụ ụgbọala Total ajuju ọnụ. Maruf kwuru na Total emeela ihe gọọmentị gwara ha mee maka ndị ihe a metụtara, dị ka inye ha ihe nkasi obi. O kwuru na Total nyere ha udu ọhụrụ ma na-agbanyere ha mmiri kwa ubọchị atọ niile. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọdọ mmanụ ụgbọala ahụ nyekwara ha igwe eji agbapụta mmiri na nke eji asa akwa. Mana ndị mmadụ kwuru na Total emebeghị ihe ha kwesịrị. Jonathan Iwelu bụ onye bi n'ebe ahụ sị: ""Anyị dọọ mmiri, Ị ga-ahụ na ọ gbanweela ọcha ya, na-esi ka mmanụ ụgbọala. Itinye ya ọkụ, o nwuru ọkụ. Ha kwesịrị inyocha mmiri ka anyị mara ma ọ dịla mma ịṅụ"". Jonathan Iwelu kwuru na mmiri a na-esi ka mmanụ ụgbọala Enuka Umeike bụ onye ihe a metụtara be ya sị ""Total agbaala anyị n'anwụ ka ọrịa dị icheiche dakwasị anyị. Anyị nwere obele ụmụaka ebe a, ha na-aṅụ mmiri a, na-egwu egwu ma na-asa ahụ n'ime ya. Mana ha amaghị na mmiri a nwere ike bunye ha ọrịa. Ya bụrụ na mba ofesi, Total ga-ahazicha ihe a etu okwesịrị kemgbe. Anyị achọghị ịga ụlọikpe mana anyị agwala gọọmentị. Enuka Umeike sị na Total etinyela ha na nsogbụ Ọkammụta Francis Duru bụ onye nkuzi na Mahadum nke Legọs, sị ""Ya bụru na mmiri na mmanụ ụgbọala gwọkọọ o nwere ike igbu nwa nọ n'afọ maọbụ nye mmadụ kansa, maọbụ mebie ihe n'ahụ mmadụ"". Ihe dịka Lead, benzene na ndị ọzọ nwere ike imebi akụ ndụ Okami Okaabi bụ onye na-arụ ọrụ ahụike na nchekwa kwuru na mmiri dị n'ime ala na mmanụ ụgbọala gwọkọọ, ọ ga-ete aka tupu ewepụ ya. O kwuru na Total kwesịrị itinye ebe ndị mmadụ ga na-eme nyocha ahụ ịhụ etu o siri metụta ha makwa kpọga ha ebe ọzọ. Ụlọọrụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na Legọs bu ""Lagos State Environmental Protection Agency"" (LASEPA) ekweghị etinye ọnu na ya bụ okwu. Ha sị ka BBC ga jụọ ndi Total maka ihe ha na-eme banyere ya bu ọdachi. Ọtụtụ obodo dị na Niger Delta nke ndịda Naịjirịa na-enwe nsogbu sitere na mmanụ agbịdị na-emebi ala ha, mana ọbụghi ihe a na-anụ mgbe niile na mmanụ na-ehi ehi site n'udu eliri n'ala." afirika-49240937,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49240937,Owerri Murder: E gbuola nwaagbọghọ ọzọ n'ụlọndina dị n'Owere,"Ka ọ na-erubeghị izuụka abụọ a hụrụ ozu nwaagbọghọ a tọgburu atọgbụ n'ụlọndina na Pọtakọt, a hụkwara ozu ọzọ n'ụlọndina ama ama nke dị n'Owere Imo steeti.","Ndị na arụ n'ụlọndịna hụrụ ozunwagbọghọ a n'okpuru akwa. Nke a mere na ngwụcha izuụka a gara aga n'ụlọndina dị na 'World Bank Road' nke Owere, Imo steeti. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ onye na-ehicha ụlọ hụrụ ozu nwaghọghọ a. Ndị na-arụ n'ulọndina a kwuru na ha anụghị mkpọtụ ọgụ ọbụla ma kwukwaa na ha amaghị mgbe nwoke ya na nwaagbọghọ a soro bịa jiri pụọ. Maazị Ikeokwu kọwara na ịchọta aha nwaagbọghọ a ga-esi ike n'ihi na nwoke ha abụọ so bịa weere ekwentị na ngwongwo nwata nwaanyị ahụ niile gbafuo. O kwukwara na ha na-eme nyocha na mgbe na-adịghị anya, ha ga-ejide onye gburu nwaagbọghọ a. Ọnọdụ nwaagbọghọ ahụ nọ dịka etu onye nke e gburu na Pọtakọt dị. Akwa ọcha dịkwa ha abụọ n'olu, dịka foto ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri. Ndị uweojii ekwubeghi na ha achọpụtala onye kpara mkpamkpa na Pọtakọt, dịka ndị nke Imo sị na ha na-asụ ọhịa ịmata nke bụ eziokwu. Akụkọ ka na-abịa. Lee akụkọ ga-amasị gị: Lee ihe nkịrị ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-44422952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422952,APC agwala Okorocha ka ọkwụsị ebo ndị isi ha ebubo,Otu ndọrọndọrọ na-achị bụ All Progressives Congress (APC) adọla aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha aka na ntị maka ebubo ha si na ọ na-ebo ndị isi otu pati ahụ.,"Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Okorocha kwuburu na onye isi oche APC bụ John Odigie-Oyegun akwanyeghị iwu ọlụikpe nyere banyere ntuliaka a ga-eji họpụta ndị ga-achị pati ha na onye ga-azọrọ ha ọchịchị n'Imo. N'akwụkwọ Bolaji Abdullahi bụ ode akwụkwọ mgbasa ozi nke APC dere, APC kọwara ebubo Okorocha boro ha ka ihe enweghị ụkwụ ọbụla, ma kwuo na ha enweteghị akwụkwọ si ụlọ iwu maka ị kwụsi ntuliaka ahụ. Abdullahi kwuru ""N'ịza ebubo aka na-achị Imo boro Oyegun na ""ọkwanyeghị ụlọikpe ugwu"" eziokwu adịghị na ya. ""Maka nke a, anyi na-agwa gọvanọ Imo ka ọkwụsị ebo ụdịrị ebubo a maka na ha abụghị eziokwu. Na-ime ntuliaka a na gbụrụgbụrụ Naịjirịa, na ị nyocha ha n'otu n'otu nakwa idu ndị ga-achi pati na steeti dị icheiche n'ịṅụ iyi, ndị na-ahụ maka ya bụ ""National Working Committee"" (NWC) soro usoro na iwu pati,"" Akwụkwọ mgbasa ozi a kwuru. APC gara n'ihu nye Okorocha ndụmọdụ ka osoro usoro iwu ha kpesa nsogbu ọ bụla maọbụ ụzọ ọbụla esi megide ya. Cheta na Okorocha na ụfọdụ ndị APC n'Imo steeti nwere nsogbu maka etu esiri mee ntulika iji họpụta ndị ga-achị pati ahụ n'Imo nakwa nkwado ọ na-enye ọgọ ya nwoke ị bụrụ aka ga-achị Imo ma ọ rituo. Lee ihe ndị kpọrọ onweha ""Restoration Group"" kwuru maka ntuliaka a na Okorocha mgbe ha mechara nzụkọ n'Abuja n'ọnwa gara aga. Ihe ndị ""Restoration Group"" kwuru" afirika-50499592,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499592,Babcock sex video: Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu',N'ụbọchị Wenesde ka mahadum a chụpụrụ otu nwata akwụkwọ ha pụtara na otu ihe nkiri ebe ha na-akwa iko nke na-ewu na sochal midia.,"N'ime akwụkwọ mgbasaozi mahadum a zitere BBC, site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Suleiman sị na ihe a mere kamgbe ọnwa Epụrel. O kwukwara na ọ bụghị n'ime ụlọakwụwkọ Babcock ka ha kwara iko a. ""A chụrụ nwoke ahụ nọ n'ime ihe onyonyo a n'ọnwa Febụwarị nke afọ a ka e mechara nyocha chọpụta na aka ya dị n'ime ajọ agwa a kpara n'ime ụlọakwụkwọ a."" Akwụkwọ mgbasa ozi ahụ kwukwara na a chụọla nwaada ahụ ya na nwoke ahụ kwara iko n'ime ihe onyonyo ahụ. Ihe gbakara ụfọdụ mmadụ isi nke mere ha jiri na-ajụ ihe kpatara nke a. Dịka o si kwụrụ ugbua, ụlọakwụkwọ a gbagidere ụkwụ n'iwu mahadum ha medidere ụdịrị agwa. Babcock bụ mahadum ụlọụka e ji Sabat mara n'ala Igbo nwe - nke pụtara ""Seventh Day Adventist Church"" na Bekee. Babcock university so n'ime mahadum ndị nkiti nwe na Naịjirịa malitere n'afọ 1999. Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Mahadum Babcock Babcock University 1) Ha na-erube isi n'omume ndị Sabat na mahadum ahụ Dịka anyị ekwuola na ọ bụ ndị Sabat nwe ya bụ mahadum nke mere ha ji erube isi n'emume ụka Sabat na-amlite namgbede Fraịde rue ehihe Satọde. 2) Iwu megidere iyi aka na-amakụ ahụ Akwa ọbụla na-amakụ ahụ esoghi n'ụdịrị akwa a na-ekwe ka ụmụakwụkwọ yiri na mahadum a. Mahadum a na-akpasị onye ọbụla yi ụdịrị akwa bịa akwụkwọ ka onye chọrọ iwakpo ndị mmadu n'ike. 3) Nwoke nanwaanyị ekwesighi iso na-aga ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge. Mahadum a machiri ụmụnwoke na ụmụnwaanyị iso na-agagharị n'ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge. Ha sị na o bụ ezigbote nsogbu ma ha hụ ndị mmadụ n'ụdịrị ọnọdụ a. 4) Anaghị anabata uwe jean na trawụza ""pencil"" Uwe jean, bụ uwe ndị mmadụ kachasị eyi n'ụwa sokwa n'ihe a machiri na ya bụ mahadụm. Uwe ụmụnwaanyi dịka ""skirt"" dị n'elu ikpere so kwa n'ihe a nabataghị. trawụza agbadaghị ala nkeọma sọkwa n'ahịa iwu. 5) Adịghị eyi ọla na iyeri Iyi iyeri ntị, iyeri imi, nke ire, nke ara na iyeri ọnụ so n'ihe ha machiri. A machikwara ịkpụ ụfọdụ isi. 6) Ụmụakwụkwọ adịghi esi maọbu rie anụ Mahadum a adịghị ekwe ka esie nri n'ebe obibi ha. Ha adịghi iri anụ, ihe ha na-eri bu ihe a kpọro ""tofu""." afirika-48672876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48672876,World Population: Ọnụogụgụ ụmụnwoke na Naijiria rịrị karịa nke ụmụnwanyi kemgbe afọ 2016- NPC,Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ mmadụ na Naijiria e kwuola na ọbụghị ihe ọhụrụ na ọnụọgụgụ ụmụnwoke karịrị nke ụmụnwanyị.,"A na-ele anya na tupu afọ 2050 ọnụọgụgụ ndi Naijiria ga-erugo nde narị anọ na ụma Otu onyeisi ndị 'National Population Commission' kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC ụbọchị Tuusdee. O kwuru na ọgụgụọnụ e mere na Naijiria na 2006 gosiri na umu nwoke ka n'ọnụọgụgụ. N'oge ahụ, ụmụnwoke nọ na Naijiria di nde iri asaa na otu, puku nari atọ iri anọ na ise, nari anọ iri asatọ na asato (71,345,488). Ụmụnwanyị dịkwanụ nde iri isii na itoolu, puku iri asatọ na isii, narị atọ na abụọ (69,086,302). Mpụtara ọgụgụọnụ 2006 A na-echebu na ọ bụ ụmụnwanyị ka n'ọnụọgụgụ n'ụwa mana nchọpụta ọhụrụ nke mba ụwa a kpọrọ 'United Nations Population Division' weputara ụnyaahụ gosiri na ọdịghị otu a. Nchọpụta ọhụrụ ahụ gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwoke karịrị nke ụmụnwanyi na Naijiria nakwa na mba ụwa. Otu UN kwuru na ọnụọgụgụ ụmụnwanyi na Naijiria dị nde iri itoolu na itoolu, narị otu puku na iri atọ na abụọ (99,132,000). Ha kwukwara na nke ndị nwoke di otu nde narị na otu, puku narị asatọ na iri atọ na abụọ (101,832,000). Ha kwukwara na ọnụọgụgụ mmadụ nile nọ na Naijiria dị nde nari abụọ, puku narị itoolu na iri isii na anọ (200,964,000). Nchọpụta ndị UN mere gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwanyị akala nke ụmụnwoke. Ọnụọgụgụ Afrịka na mba ụwa Nchọpụta ahụ gakwara n'ihu kwuo na ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n'ụwa ugbua dizi ijeri asaa, narị nde asaa na iri na atọ, puku narị ano na iri isii na asatọ (7,713,468,000). Ụmụnwoke nwoke n'ime ha di ijeri atọ, narị nde asatọ na iri asatọ na itoolu, na puku iri atọ na ise (3,889,035,000), ebe ụmụnwanyị dị ijeri atọ, narị nde asatọ na iri abụọ na anọ, puku narị anọ na iri atọ na anọ (3,824,434,000). Ọnụọgụgụ mba Afrịka dị otu ijeri na nde atọ na ụma, ebe ọnụọgụgụ mba ụwa dị ijeri asaa na nde asaa na ụma (7.7 billion). A na-ele anya na tupu afọ 2030, ndị ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'ụwa ga-erugo ijeria asatọ na nde ise na ụma (8.5 billion). ọnụọgụgụ a ga-arị ruo ijeri itoolu na nde asaa na uma (9.7 billion) tupu afọ 2050. Akụkọ ga-amasi gị:" afirika-50597418,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50597418,World Aids Day 2019: Nri ndị ga-edozi onye nwere nje HIV ahụ,Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na ụwa agwụla.,"Ihe dịrị onye ahụ ime bụ ịṅụ ọgwụ dịka dọkịta si tụzie aka ma rie ezigbo nri dịka o kwesịrị. N'emume iji cheta ụbọchị ọrịa HIV nke afọ 2019 a, BBC Igbo kpọtụrụ onye ọkachamara n'ihe banyere nri bụ Amaka Ezeoke ka ọ kụziere ndị mmadụ nri ndị ha kwesịrị ị na-eri. Ezeoke onye nwe ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' sị na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị iri kama na ọ bụ iri ezigbo nri na mgbe o kwesịrị. Ọ gara n'ihu sị na ụdị nri dịka ndị a ga-enyere onye ahụ aka; Mkpụrụosisi Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na mineral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ agha. Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere. Akwụkwọ nri O kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ. Nke na-enyekwa vitamin na mineral n'ahụ. Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na ndị ọzọ. Nrị ndị e siri n'ọkụ E ji akpụ maọbụ ọka na nrị ndị ọzọ eri ofe egusi Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe. Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-agụkarịghị nke e siri n'ezi ọ zụrụ azụ. Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri. Ịṅụ ezigbo mmiri Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere ọrịa HIV chọkwara mmiri. Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'. Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị (Sugar) ọsọ Ọ bụghị nnu niile ka a na-eri eri Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị makana ọ na-egbu mkpụrụobi onye ahụ. Belata oke abụba na mmanụ N'agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye na-arịa ọrị HIV ga-eji rie ya nke ukwuu. O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi. Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere ọrịa HIV ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, makana ọ na-enye aka imezi ahụ. Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma. Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere ọrịa HIV. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: World Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ" afirika-43043487,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43043487,Onye ọkaiwu Kenya arituola n'oche,Onye bu onye isi ọkaiwu na Kenya bụ Prof Githu Muigai aritola n'oche.,"Prof Githu Muigai kwenyebụrụ n'ochịchị Kenyatta Onyeisiala Kenya bụ Uhuru Kenyatta sị na ya ejighi obị ọcha nabata akwụkwọ Muigai jiri si ya na ya adịghị arụzi ọrụ. End of Twitter post, 1 Prof Muigai, bụ onye rụrụ ọrụ ka okaiwu na Kenya kemgbe afọ isii, pụtara na akụkọ na nso ka ọ na ekwu na ọ ga akụ onyeisi ndi na-anọghi n'ọchichi bu Raila Odinga ebubo ka onye na ebuso obobo agha ma ọ ṅụọ iyi ka onyeisiala Kenya. Kenyatta ewepụtala ọkaikpe Paul Kihara Kariuki ka onye ọzọ ga anọchite anya Muigai." afirika-47774739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47774739,NFF Awards: Ahmed Musa ejirila ụkwụ gbata 'goal of the season',Ahmed Musa gosiri ụwa ihe e ji ụkwụ eme ka goolu o nyere n'asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2018 nwetara ihe nrite bekee kpọrọ 'goal of the season'.,"Cheta na goolu Musa ahụ, bụ nke o nyere ka Naịjirịa zutere mba Iceland, banyekwara na goolu ndị ngalaba FIFA họpụtara maka ndị kacha kpụrụ ọkụ n'ọnụ na ya bụ asọmpi. Ọnwa Musa tirila na-aga n'ihu ka o ritekwara nwoke kacha agba bọọlụ na Naịjirịa. End of Twitter post, 1 Ebe Onome Ebi nke Super Falcons ritere nke ụmụnwaanyị. Samuel Chukwueze nwetara nzere ""onye na-eto eto kachas agba bọọlụ"" nke ụmụnwoke. Anam Imo nke Falconet ritere nturugo dịka ọkaibe n'egwu bọọlụ ndị na-eto eto na mmeme e mere n'abalị Fraide na Legọs. Imo nwetara nzere 'Young Player of year'. Onye nchịkọta otu Super Falcons bụ Thomas Dennerby, nwetakwara nzere onye kacha achịkọta otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị. Ebe otu Super Falcons bụ ndị ọ na-achịkọta nwetara nturuugo dịka otu ụmụnwaanyị kacha agba. N'aka nke ọzọ, onye nchịkọta otu egwu boolu Rangers Internationa bụ Gbenga Ogunbote ritere nturuugo dịka 'onye ncghịkọta boolu ọpụrụiche (Coach of the year.) Ndị na-akwado otu Kano Pillars nwetara nzere ""ndị nkwado kacha mara ihe egwu na-akụ"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45477513,https://www.bbc.com/igbo/45477513,"Onye hụrụ ube rachawa ya, anaghị ahụ ụbe kwa daa",Kedụ ebe i so; i so na ndị na ndị na-ara ube ara ka i so na ndị na-aracha ya aracha?,"Ube na-edozi ahụ Ube bụ mkpụrụ osisi Chineke nyere ndị Afrịka. Dịka ihe nile nwere oge, oge ube bụ onwa Juun rue ngwucha ọnwa Sepụtemba kwa afọ. Osisi ube na-eji ihe ruru ọnwa abụọ na ise amị okooko (flower) ya. Ube na-atọchị ntị ma e jiri ọka taa ya Ube na ọka na-agakọ Mgbe nke a mechere, ọ na-amalite ịmị mkpụrụ ya na mbido udummiri. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta ube ka mkpụrụosisi e ji emegharị ọnụ mana n'ezie, ube karịrị nke a. Ube na-enye ọtụtụ ihe na-edozi ahụ ma na-enyekwa ahụ ihe. Ya kpatara o ji dị mkpa ịracha ube nke ọma n'oge ya. Ube na edozi ahụ Gịnị ka ube na-enye n'ahụ? Ya bụ onye hụrụ ube rachawa ya na-adịghị ahụ ube kwa daa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari n'ahụ gị" 48486899,https://www.bbc.com/igbo/48486899,Enugu state: Nwoke egbuola ibe ya maka otu nzuzo,Ndi uweojii n'Enugwu steeti anwuchiela Izuchukwu Ifeacho bụ onye a na-enyo na o gburu otu nwoke aha ya bụ Iruchukwu Nnebe.,"Ndị jidere nwoke gburu ibe ya Akụkọ kwuru na Ifeacho ji mma sụgbuo Nnebe makana ọ chọrọ ịmanye ya ka ọ banye otu nzuzo ha. Iruchukwu bụ onye nọ na ọbaozu dị n'Oji River ugbua gbara afọ iri abụọ na ise. Ha abụọ bụ ndị Amankpunato, okpuruọchịchị Oji River Government. Ndị uweojii wetere nma eji gbuo ya bụ nwaamadị. Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti, kwuru na ha na-etinye anya ka ha mata nke bụ eziokwu na ya bụ okwu. Orji Uzo Kalu na-akwado Femi Gbajabiamila Akụkọ na-akọwa na Orji Uzo Kalu bụ aka chịburu Abia steeti, na-akwado Femi Gbajabiamila dịka onyeisi ụlọomeiwu nta. Arewa Youth Awareness Forum ekwuola na ya bụ nwaamadị amasighị ha dịka onyeisi n'ọgbako nke itoolu. N'akwụkwọ ha depụtara nke Mohammed Kabir na ndị ọzọ tinyere aka, ha sị na ya bụ nwaamadị etozughi ịchị ya bụ ụlọomeiwu nta. Trump awụchiela UK N'ofesi, Onyeisiala Donald Trump nke mba Amerịka awụchiela mba UK n'ụtụtụ Mọnde ime njem nleta na mba ahụ. Ọtụtụ ndị iwe dị n'obi na-akwado ngagharịiwe dị icheiche ebe ahụ maka ọbịbịa ya. Lekwa ọtụtụ ebe Trump gara kemgbe ọ bụrụla onyeisiala Amerịka: Trump na Kagame nwere mkpakorịta na Davos Jurgen Klopp a ga-achịrị Liverpool gawa? Jurgen Klopp dị afọ iri ise Igbo si na ụra tọwa ụtọ e kwowe ya ekwo. N'ihi ya, ndị isi otu egwu bọọlụ Liverpool na-akwado itinye aka n'akwụkwọ Jurgen Klopp ka ọ chịrị ha gawa. Nke a na-eme ka ha buchaara Iko Champions League n'izu gara aga. Akụkọ ga-amasị gị" 43034944,https://www.bbc.com/igbo/43034944,Onyinye na-edoghị anya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-enye,Kedụ ihe kpatara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji enye ndị ha na-anọchite anya ụdị onyinye ndị a?,"Ite eji eghe ihe abụghị nanị onyinye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa na-eke N'ụbọchị ole na ole gara aga, onyinye Sinetọ Mao Ohuabunwa na-anọchite anya ndị Abia North na Sineeti bụ okwu ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'igwe okwu Twitter. Ụfọdụ nọ na-ajụ ihe kpatara ọ ga-eji nye ndị mmadụ ite eji eghe ihe na ekwuọkụ gaasị ebe ọ sị na ọ bụ nkwadolite ka ọ chọrọ ime ha. Mana BBC gbara Mao Ohuabunwa ajụjụ ọnụ ebe o kwuru sị na onweghi mwute maka ihe o mere. Ọ gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ iji mezupụta nkwa ya kwere ndị mụrụ etu e si eghe ihe na 2017. Ọ sị na ọbụghị nanị ite eji eghe ihe na ekwuọkụ gaasị, na o nyekwara onye ọbụla n'ime ha puku 50. Sinetọ Mao Ohuabunwa kọwapụtara ihe kpatara o jiri nye ndị ọ na-anọchite ite eji eghe ihe Sinetọ Ohuabunwa abụghị nanị onye ndọrọndọrọ ọchịchị nyerela ndị mmadụ ụdị onyinye a. Lee ndị ọzọ ebe a: Ụdị onyinye a o nwere ike ịkwụsị na Naịjirịa?" afirika-49124337,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49124337,Ọbụghị eziokwu na anyị amachịela ịtụbata mmiri ara - CBN,Ụlọ akụ ọha nke Naịjirịa bụ Central Bank (CBN) awụọla mmiri oyi na akụkọ na-efegharị n'ikuku maka mmachi ibubata mmiri ara ehi.,"Central Bank, na-akwụkwọ mgbasa ozi he weputara n'akara Twitter ha sị na onweghị mgbe ha jiri chọọ ịmachị mmiri ara ehi si ofesi. Ha si na ha chọgọdị ime ụdịrị ihe, ha enweghi ikike ya. End of Twitter post, 1 Ụlọ akụ a sị na ihe ha chọrọ ime bụ ibelata ego ofesi ha na-enye ndị na atụ mgbere mmiri ara ehi si ofesi. Ha sị na nke a bụ iji nye mmepụta mmiri ara na Naịjirịa aka. Central Bank sị na kemgbe afọ iri isii ndị Naịjirịa nwere nchekwube na mmiri ara ehi si ofesi - bụ ọnọdụ ọ sị agaghị enyere mba ahụ aka. Ha kwukwara ha ga-enye ndị chọrọ imalite ịmepụta mmiri ara ehi na Naịjirịa aka ịhụ na atụmatụ ha pụtara ihe. Ndị mmadụ tiri ezigbote mkpu maka akụkọ pụtara na. Oby Ezekwesili, bụ onye bụbụ Minista na-ahụ maka nkuzi, nakwa nke ọra dị n'ala sokwa tinye ọnụ. Ezekwesili sị na atụmatụ CBN ga-eme ka mmiri ara kọọ ma bulie ego ya elu. Onye ọzọ ji akara @FinPlanKaluAja juru ma mmachi ọ ga-eme ka ụlọ ọrụ na-arụpụ mmiri ara ehi dị na Naịjirịa. Tunnji Andrews dere na atụmatụ a CBN wepụtara ga-ewepụ ụzọ ụmụaka si ewete ihe metụtara erimodo." afirika-52663189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52663189,Coronavirus in Nigeria: Gịnị mere na adịghị egosi anyị ime 'isolation centre'?,Ọrịa coronavirus adịla ka otito na-adịghị ala ala n'ahụ ụmụ ụwa.,"N'izuụka a niile, ihe ụmụ Naịjirịa kpụ n'ọnụ bụ ka e gosi ha ime ụlọ ndopu ebe a na-edowe ndị na-arịa ọrịa coronavirus. Ụfọdụ na-ajụ ajụjụ a kwuru na ha ekwenyeghi na e nwere ihe dị ka ọrịa a, nke ha ji ekwe na ọ batala na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) na-ewepụta ọnụọgụgụ ndị butere ya ọhụrụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ ndị a gara n'ihu sị ka e gosi ha ihe onyonyo ndị bu ọrịa a ebe ha nọ n'ime ebe a na-elekọta ha bụ ""isolation center"" na Bekee, maọbụ ka e depụta aha ha. N'ihi ekweghi ekwe a, BBC Igbo gbara mbọ jụọ ndị mmadụ na soshal midia ma ha a ga-achọ ka ebiputa aha ha ma ọ bụrụ na ha bu ọrịa a. BBC Igbo gara n'ihu jụọ ndị kọmịshọna ahụike steeti dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ihe mere ha ji ghara ị na-egosi ndị mmadụ ime ""isolation centre"" ndị a, lee ihe ha kwuru: Dọkịta Vincent Okpala bụ kọmịshọna ahụike nke Anambrasteeti kwuru na ọ bụ ihe dị mma igosi ndị na-arụ ụka maka coronavirus. O kwuru nke a na mkparịtaụka onye kwuo uche ya nke BBC Igbo kpọrọ ya. O kwuru na tupu e mee nke a, a ga-enwe nkwekọrịta na mbinyeaka n'akwụkwọ si n'aka ndị na-arịa ọrịa, ma emeghị nke a, ndị ahụ nwere ike ịgba gọọmenti akwụkwọ. O kwuru na ihe ọzọ ya bụ atụmatụ nwere ike ibute bụ akaja nye ndị na-arịa coronavirus. Okpala kwuru na onye ọbụla na-achọsi ike ịhụ ime ụlọ ebe ndopu nwere ike ịkpọ ụlọọrụ NCDC ka ha kpọbaa ya ebe ahụ maọbụ kọwaara ya ihe niile ọ chọrọ ịma. Ebonyi steeti Kọmịshọna ahụike nke steeti ahụ kwuru na ha na-egosi ""isolation center nke ha"" kama na agaghị egosi ihu ndị mmadụ maka ihe so ya. Ọ gwara anyị na ndị ntaakụkọ na-abata n'ime ụlọ ndopu dị n'Ebonyi steeti ahụ, wee na-ese ndị mmadụ onyonyo. Abịa steeti Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Abịa steeti a bụ Jonathan Osuji kwuru hohaa na ha agaghị emeli nke a n'ihi na ndị ọbụla na-arịa ahụ kwesịrị ka a ghara ịgba ha n'anwụ. O kwuru na o cheghị na ya bụ atụmatụ dị mma. N'okwu ya, ""onye ọbụla chọrọ ịmata etu na ndị nọ n'ụlọ ndopu nọ nwekwara ike ịkpọ ụlọọrụ NCDC n'ekwentị ma gwa ha na ha chọrọ ịhụ n'anya, mana ha hụchaa ha, ha chere mee nyocha ka ha mara ma ha ebutela ọrịa coronavirus. Imo steeti Anyị gbalịrị ka anyị nụta n'ọnụ kọmịshọna ahụike nke Imo steeti mana ọ bubeghị ekwentị ya. Mana lee mkparịtaụka anyị na ya nwere n'oge gara aga gbasara ọrịa coronavirus. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46629929,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46629929,TGIF: Kedụ ihe ị ga-ejiri onwe gị mee n'abalị Fraịde?,Fraịde bụ ụbọchị ọtụtụ ndị mmadụ kachasị ele anya n'elekere ha.,"Ngwụcha izu eruwela ya mere onye ọbụla ji n'eche ka ha gbasaa ọrụ were nwee ike ibido mewe ihe niile ha bu n'uche ịme kemgbe izu bidoro. Ị rụọla ọrụ izu niile, o ruola oge ị ga-eji nedo onwe gị anya. Onwere ike bụrụ na ihe iji ele elekere gị kwamgbe kwamgbe bụ ka imara oge agbantịlọ ji ebido. Nwekwaa ike ọbụrụ na ọ bụ achọpụ ị ga akụ ma ịnaruo ụlọ bụ ihe dị gị n'uche. Nke ọbụla ọ bụ, ya bụrụ na ọ bụghị ajọ ihe, anyị kwụ gị n'azụ. Ka anyị lezie anya hụ ihe dị iche iche ndị mmadụ na-eme n'abali fraịde mara ma ịga ahụ onwe gị na nke ọbụla. 1) Ụfọdụ na-agba agbantịlọ Ịgba egwu bụ otu ụzọ eji ebelata mgbakasị ahụ dị anyị n'ahụ. Ma ị na-agbakwa ya bụ oringo, uche gị dikwa ya. 2) Ndị na-agụ akwụkwọ Onwere ndị bụ akwụkwọ ka ha ji agbanahụ ọgbaghara juru n'ụwa. Ha kọọrọ gị akụkọ dị n'ime akwụkwọ ahụ, ị ga-eche na ha nọ mgbe o mere. Ha gụba ya bụ akwụkwọ, onweghị ihe ị na-ekwu ha ga-anụ. Nke a magburu onwe ya, ma gbaa mbọ hụ na ụbụrụ gị zuturụ ike. 3) Ụfọdụ na-ekiri ihe nkiri Ndị nke a dịkwa ka ndị akwụkwọ. Ha chedo anya na televishọn, kwuo elu, kwuo ala, anya ha agaghị esi ebe ahụ pụọ. Ọ dị mma iji ihe nkiri enweta onwe anyi, kama chetekwa na ọ dị mkpa ka anya gị zuo ike. 4) Ndị na-ehi ụra Ị nụtugo maka ndị n'akwụ ọtọ were na-ehi ụra? Onwere ndị ura bụ etu ha si ezu ike uwa. Ọ Bụrụ na nke a bụ gị, ọ dị mma, ụra dị mkpa maka ahụ ike uche anyị. 5) Ndị na-agba egwu n'ụlọ naanị ha Ndị a bụ ndị onwe ha n'atọ ka shuga. Ha ga anọnwu naanị ha ruo mgbe ebighi ebi, ọ gaghị emetụ ha. I so na ndi a? Kpọnye egwu Maazi Phyno bụ Ọbiagụ, gbarịba egwu! 6) Ụfọdụ na-egori n'ụlọ enyi ha Ndị oyibo kpọrọ ya ""sleepover"". Onwere ndị bụ izukọ n'ụlọ enyi ha, kparịta ụka, rie nri na hie ụra ka ha ji enweta onwe ha na Fraịde. Ọ dị mkpa na ndị enyi zukọọ, akparịta ụka. O nwee ihe na-enye otu onye nsogbu, o kwuputee ya ka ndị ọzọ nyere ya aka. Ị hụ mmadụ, mmadụ ahụkwa gị. 7) Ụfọdụ ana-eneta ahụ ha anya Onwere ndị bụ na ngwucha izu ka ha ji apa onwe ha apa ka akwa. Ha ga-ehicha ihu ha ka ọ bụ afere nkụwa, tee ude n'ahụ ha ka ọ bụ enyo, ma were mmiri ṅujuo afọ ka ahụ ha were na-emuke. Jisie ike ma ọ bụrụ na ị so na ndị a. 8) Ndị na-arụ ọrụ n'abali Fraide Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ site na Fraide pụta na Satọde. Ọ bụrụ na anyị arụghị ọrụ, anyi agaghị enwe ego aga-eji ledo onwe anyi anya. Ya bụ na ọrụ dị mkpa. Kama na ị na arụ, kawaa ahụ cheta izu ike ma mesapụ ahụ. Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị" afirika-47339126,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47339126,Ihe amabeghị ihe ọ bụ gbara n'Enugwu n'abali,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ogbunigwe amaghị ndị tụnyere ya gbara n'Otigba Junction dị n'Enugwu.,"Onweghị onye nwụrụ n'ọdachi ahụ nke mere n'ime ụgbọala bu ndị mmadụ na nso Otigba ka o ji ihe dịka nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke abalị. Mana ndị nọ n'ime ụgbọala ahụ merụrụ ahụ. Oge onye ntaakụkọ BBC rutere ebe ahụ, ọ hụrụ ka akwa na ngwogwo fesasịrị ebe ahụ. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nụrụ ka ihe dara oke ụda. Ka ọ dị ugbua, ndị ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe erutela ebe ahụ inyocha ihe gbara ma ọ bụ ogbunigwe ma ọ bụghị ya. Akụkọ ka na-abịa Sexual abuses in Catholic Church: 'Taa Bishọp ọbụla gbuchiri fada na-akpara akwụ ahụhụ' Iwu megidere ndị ụkọchukwu Katọlik ịlụ nwaanyị Cardinal Blase Cupich nke Chicago dị n'Amerịka akpọọla oku ka ewepụta iwu ọhụrụ ga na-ata ndị Bishọp ahụhụ maka ikpuchi ndị ụkọchụkwu na-akpa arụ n'ụka Katọlik. Cupich kpọrọ oku a n'ọgbakọ Popu Francis kpọrọ na Vatican City banyere mkpesa metụtara mmetọ ndị ụkọchụkwụ ụfọdụ na-emetọ ndị chiri sista nakwa ụmụaka nke a madoro akwa ọtụtụ afọ gara aga. Achọghị m ime Naijiria mba na-ekpe ụka Alakụba Muhammadu Buhari gwara ụmụ Naijiria ha ekwela ka onye ọbụla nagha ha ịtụ vootu echi Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari agọọla agụgọ sị na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ọ chọrọ ime Naijiria obodo na-ekpe ụka Alakụbabụ ụgha mabụrụkwa aka ọrụ ndị arụrụala chọrọ ibute nkewa. O kwuru na ya kwudosiri ike na iwu ala Naijiria. N'aka nke ọzọ, Buhari n'ozi ọ gbasara n'Fraide n'ihe onyonyo gbara ụmụ Naijiria ume ka ha pụta n'igwe tụnyere onye masiri ha na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-eme ụbọchị Satode. Ndi uweojii dị njikere maka ntuliaka -FPPRO Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mbah ekwuola na ndị uweojii ezipụrụ ọrụ nọna makụkụ dị iche iche na Naijiria adịla njikere ịhụ na udo chịrị dịka a na-eme ntuliaka Satode. Ọ dọrọ aka na nti ka ndị agbaro na omekome gbara ọgwụ ha nụọ n'ihi na ndị ọrụ ha ga-anyụ onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaghara ebe a na-eme ntuliaka ịkpakwụ. Ụkwụ atọla Chelsea n'ama Bertrand Traore nyere goolu anọ na asọmpi 16 o soro Chelsea gbaa N'egwuregwu, Fifa amachiela otu egwu bọọlụ Chelsea ịzụ ndị egwu were ruo afọ 2020 maka ịda iwu ịzụ ndị egwu bọọlụ na-etorughị afọ iri na asatọ.eto." afirika-48682133,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48682133,Nnamdi Kanu: Ọkaikpe abiaghị ụlọikpe,Ọkaikpe Jọstịs Binta Nyako bụ onye nọ n'isi ikpe Nnamdi Kanu abịaghị ụlọikpe ukwu nke etiti dị n'Abuja taa.,"N'abalị 23 nke ọnwa Maach, Jọstịs Nyako nyeburu iwu ka anwụchie Kanu maka ịjụ ịpụta n'ụlọikpe kemgbe April 25, afọ 2017 na-enweghị nkọwa doro anya. O higharịrị ikpe ahụ ruo ụbọchị June 18 mana Jọstịs Nyako bụ onye nọ n'isi abịaghị ụlọikpe n'ihi 'na ahụ adịghị ya.' Ndị ọkaiwu abụọ; ma ndị na-anọchite gọọmenti ma ndị na-anọchite Kanu, na ndị ọrụ ụlọikpe (court registrar) tụkọtara isi ọnụ ma nwe nkwekọrịta, were higharịa ikpe ahụ n'abalị 31 n'ọnwa Ọktoba, afọ 2019. Dịka nke a na-eme, o doro ewu na ọkụkọ anya na Nnamdi Kanu anaghị arọ nrọ ịbịa ụlọikpe maka okwu ahụ. Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya Ozi o wepụtara n'igwe Twitter ya gosiri na ọ nọ mba Amerịka ebe ya na ndị otu ya na-enwe nzukọ dị icheiche gbasara nnwereonwe Biafra. N'aka nke ọzọ, Nnamdi Kanu etiela mkpu si na ndị Fulani ekwojuola Alaigbo na-eche ka e nye ha iwu ịkpa mkpamkpa n'Ọwụwa-Anyanwụ. Kanu, onye kwuru nke n'ozi ọ gbasara n'abali Juun 18, afọ 2019 riọrọ Chineke ka onye ndi otu ya amamihe ịtụpụta ụzọ mgbapụ na nsogbu ahụ ahụ. Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche Cheta na a na-ekpe Kanu bụ onye ndu otu na-achọ nwereonweonye Biafra ikpe maka ebubo mpu megidere Naijiria. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Nnamdi Kanu na BBC Igbo Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa" afirika-46785034,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46785034,Gabon Coup: Ụzọ ị ga-esi mara na ndịagha ewerela ọchịchị n'ike,Ọ bụ n'ụbọchị Mondee nke ọnwa Jenụwarị ka ụfọdụ ndịagha na mba Gabon nwụchiri otu ụlọ mgbasa ozi n'ihe Bekee kpọrọ 'Coup'.,"Mana chi ejighi mgbe achụsoro ha bụ ndịagha nupuru isi ma kpọchikwa ha. Ọ bụghị sọsọ na Gabon, n'afọ 2014, ihe yiri ya mere na mba Gambia mgbe ndịagha nwara ị nara ọchịchị n'ike. Ọgbaghara na akụkọ ụgha na-ewu ewu n'ụdịrị oge ahụ ya mere na BBC Igbo ga-agwa gị ụzọ ị ga-esi mara ma anapụọla ndị isiobodo ọchịchị n'ike. Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị Ndị agha, ọ kachasị ndị na-anara ọchịchị n'ike agaghị ekweta na ọ bụ ihe ahụ ka ha na-eme. Ị kwesiri ị gbaalị chọpụta nke bụ eziokwu, hie asaa n'anya ka ị nweike gbalahụ nsogbu. N'ime ọgbaagahra niile na-eme, o nwereike ị bụ na ndịagha nara ọchịchị n'ike anwụchiela onyeisiala na be ya. Chọpụta ebe onyeisiala nọ, ọ bụrụ na ahụrụ ya anya ma nụ olu ya, mara na ihe niile dị mma. Ọ bụghị iwu na ị ga-apụta n'ụlọ gị mana legharịa anya n'akụkụ gị; ndị mmadụ nwereike ị naa-akwa mgbọ ma na-emekwa ngagharịwe. Dịka gọọmentị mba Amerịka siri mee na afọ 2017 mgbe echere na anapụla ọchịchị n'ike na mba Zimbabwe, gọọmentị ndịọzọ ga-ezipu ozi ị dọ ndị be ha aka na ntị. N'ihe yiri okwu Gabon, ndị na-achọ ị nara ọchịchị n'ike na-aga n'ụlọ mgbasaozi obodo nwụchie ya iji zipụ ozi na ha anọchiela ọchịchị. Nke a bụ iji belata njem nakwa ọgbaghara nwereike ị bido maka akụkọ na-anapụla ndịisiala ọchịchị n'ike. Ọ na-adị mma ka ndị mmadụ nọrọ be ha chekwq onwe ha tupu a mara nke bụ eziokwu mgbe ọbụla kepu kepu pụtara na ndịagha anapụla onyeisiala mba ọbụla ọchịchị n'ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45943214,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45943214,Nnamdi Kanu bụ onye ụjo na-eduhie ụfọdụ ndị ntoroọbịa - SERG,Otu kpọrọ onwe ha South East Renewal Group (SERG) amaala onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu aka n'ihu dịka o mechara mgbasa ozi n'igwe redio.,"Otu a gwara Kanu na ọ bụrụ na ọ kpọrọ onwe ya dike Biafra ka ọ wụchie gosi onwe ya na abụghị ị nọ na mba ọzọ agbọ ụja. N'ozi nke si n'ọnụ onyeisi otu a bụ Charles Mbani, o kwuru na ọ bụ ihe nwute na Kanu bịara ibute ọgbaghara n'etiti ndị ọwụwaanyanwụ. O kwuru na ndị Igbo agbakechabeghi site na nsogbu ya na ndị otu IPOB ya tinyere ha n'otu afọ gara aga. Mbani kwuru na Nnamdi Kanu na ndị otu IPOB ya anaghị ekwuchite ọnụ ndị Igbo niile. N'okwu ya "" Kanu bụ onye ụjọ na-eduba ndị ntoroọbịa Igbo na nsogbu nakwa ọnwụ ha na-erughi eru."" ""Ya mere SERG na-agwa Kanu na ndị otu ya na ndị Igbo ga-apụta n'uju ime ntuliaka n'afọ 2019 na-enweghi mkpagbu ọbụla."" Mbani kwuru na Kanu maa ụkwụ n'ala Igbo na ndị ntoroọbịa Igbo ga-eji aka ha nwụchie ya ma nyefe ya n'aka ndị uweojii. Akụkọ ndị ga-amasị gị: IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta" afirika-53492757,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53492757,Akpabio na ndị omeiwu: 'Iwu Naịjirịa enyeghị ndị omeiwu ikike ịnara ọrụngo',Ndị ọnụ na-eru na-okwu ekwuola na ọ jọgburu udela ma sigbuo nkakwụ ndị ụlọomeiwu ịnara ọrụ na NDDC.,"Obinna Ede na Malachy Ugwummadu bụ ndị okaiwu sị na ha dara iwu maka na ha agaghị na-akụ nkwa ma na-etekwa ete otu mgbe. Ha kwekọrịtara na ọ bụ ọrụ ndị omeiwu ịlekọta ọrụ gọọmenti ịmata ka ya bụ 'ọnwụ egbukwara ka a rụrụ aka.' Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamile enyela Godswill Akpabio abalị abụ ịkpọpụta aha ndị niile ọ sị weere ọrụ na NDDC. Dịka ndị mmadụ na-ekwu maka ihe mere ụnyaahụ n'ụlọomeiwu nta mgbe a na-agba mịnịsta Niger Delta bụ Godswill Akpabio ajụjụọnụ. Otu n'ime ihe ndị pụtara na nnyocha ahụ bụ ebubo Akpabio boro ndị omeiwu nke ọ sị na ọ bụ ndị omeiwu ji ọtụtụ ọrụngo si n'aka ụlọọrụ NDDC. Nke a gbakara ndị mmadụ isi nke mere ọtụtụ ji jụwa ajụjụ dị iche iche. Otu n'ime ajụjụ ndị a bụ na ""Ọ bụ ihe ọjọọ ma ndị omeiwu nara ọrụngọ mgbe ha nọ n'ọchịchị?"" Otu onye ọkaiwu kajara akaja ọnụ na-eru n'okwu bụ Malachy Ugwummadu sị na ""ọ jọgburu onwe ya ndị omeiwu itinye aka n'ọrụngo mgba ha nọ n'ọchịchị"". Malachy Ugwummadu bụ ọkaiwu nakwa ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere mmekọrịta ọha. Ugwummadu sị na nke mbụ, na agwa a ha kpara megidere usoro okike ọrụ na gọọmenti nke Bekee kpọrọ 'seperation of powers"". Ọ sị na ọrụ ndị omeiwu bụ ịlekọta ka e sị rụọ ọrụ, na ọ bụghị ịweghara ọrụ. Na ọ bụ ya ka Bekee kpọrọ ""conflict of interest"". Ọ sị na ọ bụ ebe ahụ ka ha sị kụọ isi n'ala, maka na o megidere iwu obodo dị n'agba nke iri asatọ na asatọ, amaokwu nke anọ (Section 88, sub-section 4) nke iwu ọchịchị Naịjirịa. O kwukwara na ya bụ ajọ agwa gosipụtara mpụ na nrụrụaka kere gọomentị etiti agbụ bụ nke ekweghị ya megherịa ahụ. Ugwummadu sị na nke ka njọ bụ na ọrụngo a niile ha nyere esoghi n'usoro okwesịrị dịka ụlọọrụ Code of Conduct Bureau si depụta n'akwụkwọ iwu ha. Mgba ajụrụ ya maka iwu onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila nyere ka Akpabio kpọpụta aha ndị ọ sị naara ọrụngo na NDDC, Ugwummadu sị na ọ bụ nke ahụ ga-eme ka ndị omeiwu gbaa onwe ha n'anwụ. Ọ sị na ya nwere olileanya na dị mmadụ, ọkachasị ndị Niger Delta ga-akwanye ọkụ n'okwu ahụ nke ga-eme ka Akpabio kpọpụta ha ndị a niile. Ọ sị na obi adịghị ndị Niger Delta mma mgbe ha nụrụ na ọ bụ Akpabio ji ọkwa mịnịsta Niger Delta. Mana Ugwummadu nwere okwukwe na okwu a bụ oke ikuku kuru ga-eme ka ahụ ike ọkụkụ. Edeh n'onwe ya chere na ọnweghị ihe ga-apụta na ya bụ okwu, ọgwụchaa ma onyeisiala etinyere ya anya. O kwukwara na ndị omeiwu ikpe mara nwereike ị nweta onwe ha na mkpọrọ ma onyeisiala sie ọnwụ ka ya bụ okwu soro usoro dịka iwu kwuru. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50624157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50624157,Norwich City vs Arsenal: Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike,O rubeghi abalị abụọ kemgbe ndị isi Arsenal chụrụ onye nkuzi ha bụ Unai Emery mana ha ka jikwa ka ha ji.,Nke a pụtara ihe taa dịka ha na otu Norwich City gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere. Pukki nke Norwich City pịawara goolu mbụ na nkeji 21 nke Aubameyang nke Arsenal sara ya na nkeji 29. Cantwell nyekwara goolu ọzọ na nkeji 45+2 nke pụtara na Norwich city nọ Arsenal n'ihu na ngwụcha agba nke mbụ. Aubameyang gbara penariti nke onye nche otu Norwich chetara na mbido agba nke abụọ. Ogbu opi kwukwara ka agbagharia ya bụ penarịti nke ghọrọla goolu nke abụo nyere ndị Arsenal. Arsenal nwara ike ha ị meri ya bụ asọmpị mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ha ga-ezute otu Brighton n'ụbọchị Tọzde ebe Norwich City ga-ezute otu Southampton. afirika-47858758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47858758,Sudan: Ndịagha ewerela ọnọdụ ọchịchị ugbua,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndịagha ewepula onyeisiala mba ahụ bụ onyeisiala Omar-Al-Bashir.,"Ndị agha na mba ahụ si n'ozi ha ziri n'igwe onyonyo kwuo na ha ewerela ọnọdụ na mba ahụ. Ha kwuru na ndịagha ga-anọ n'ọchịchị afọ abụọ iji nọchi anya ndị mmadụ ma mee uche ha ka ha sị chọ ya. Ihe ọzọ ha kwuru n'ụdị nkọwa bụ na ""ndị ogbenye ka dara ogbenye, ndị ọgaranya ka bụ ọgaranya"" Akụkọ si na Sudan pụta n'ụtụtụ kwuru na a na-anụ ụda egbe ugbua na mpaghara ahụ. Nke a mere na ndị mmadụ na-agbagharị ịchọta mkpuchi n'ebe dị icheiche. Tupu nke ahụ emee, ndị hụrụ ebe ihe mere gwara BBC na ndịagha agaala n'ụlọọrụ otu nọ n'ọchịchị na-ezu ihe. ""Anyị na-eche ozi dị ukwu gbasara ọchịchị anyị"" ka otu onye gwara onye ọrụ AFP nọ ebe ihe na-eme. O gafeela elekere anọ kemgbe ndịagha kwere nkwa na ha ga-ezi ozi gbasara ya bụ ọkwa ọchịchị na Sudan. Otu nwaanyị agbarala aka nwa n'ọgbaghara Sudan Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụfọdụ ndị agha bịara gboo ọgụ dịka ndị ọrụ nchekwa na ndị na-eme ngagharịiwe kụkọrọ isi na Khartoum,isi obodo Sudan. Ndị agha gbalịrị ịchụsasị ụgbọala na-agba ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe egbe na ikuku anyammiri(tear-gas). Ndị a na-akpọ oku ka onyeisiala Sudan bụ Omar al-Bashir rituo n'ọchịchị. Onyeisiala Bashir wezụgara iwu ala ahụ nakụkụ n'ọnwa Februwarị Bashir, onye banyere ọchịchị afọ ịrị atọ gara aga jụrụ inye ohere ka ọchịchị ọzọ bata. Ndị na-eme ngagharịiwe gbagara ọsọ n'ogige ndị agha ụgbọmmiri dịka egwu dị n'etiti ndị agha. An army vehicle passes protesters near the military HQ on Monday morning Dịka ndị ọrụ gọọmenti siri kwuo, mmadụ asaa anwụọla kemgbe Satode ọgbaghara ahụ bidoro. Ihe mere n'abalị ụbọchị ụka Ngagharíiwe e mere úbóchí Satóde mere n'ótú obodo mepere emepe na Sudan Otu onye so mee ngagharịiwe gwara BBC na ụgbọala na-agbakasị ndị na-eme ngagharịiwe egbe na ikuku anyammiri dịka ka ha gbakọrọ na Khartoum. Mgbe nke a mere ndị agha gbara nkịtị maka ha nọkata gboo ọgụ site na ịchụsasị ndị ọrụ nchekwa. Gịnị na-ese? Ihe buteburu ngagharịiwe bụ oke ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa mana ugbua ndị mmadụ na-akpọ oku ka onyeisiala ha gba alukwaghịm. Akụnaụba Sudan na-akpụ afọ n'ala nkemgbe afọ iri abụọ gara aga dịka mba Amerịka machiri ha maka ebubo ịkwado ndị na-eyindu egwu. N'ọnwa Disemba, gọọmenti ha mara ọkwa na ọnụ mmanụ ụgbọala na achịcha bekee ga-agbalite elu dịka ego ha bụ Sudan paụnds kpụrụ isi n'ala. Kedụ ndị na-eme ngagharịiwe? SPA - Njịkọta ndị ọụahụike na ndị ọkaiwu bụ ndị na-ahazi ngagharịiwe ahụ Ndị dọkịta bụ ndị bu ọgbaghara ahụ n'isi nke mere ka ndị ọrụ gọọmentị na-achọsị ha ike. A na-eche na ụzọ abụọ n'ime atọ ndị na-eme ngagharịiwe bụ ụmụnwaanyị." afirika-45555446,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45555446,Ọ bụ ndị eleghị anya na ndị azụ anụụka na-ebute mberede ụgbọala?,"Otu nwoke aha ya bụ Olabode gbara n'ụlọikpe ime obodo dị n'Ikeja, Legọs maka ebụbọ iji ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze ya kwọgbuo nwatakiri onye agbataobi ya gbara afọ atọ.","Mberede ugbọala na-ebute atala isi ọtụtu mmadụ Akụkọ kọrọ n'ụgbọala Olabode kwọgbụrụ ya bụ nwa ka ọ na-ala azụ. Ya bụ nwoke bi n'Ikeja ka a na-ekpe ikpe ọchụ nakwa amaghị akwọ ụgbọala nke ọma. Onye okaiwu na-ekwuchitere nna nwa ahụ ọnụ ya kwuru na ya bụ ọdachi dara n'ehihie mgbe ọnwa Septemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na ise na obi ha dị na Ikeja. Mkpara ụlọikpe Nna ya bụ nwata na-eche na Olabode hiri asaa nabọ n'anya were gbuo nwa ya maka na ha abụọ nweburu esem okwu. Ọkaiwu nna nwata ahụ sị na agwa a ọkwụụgbọala a kpara megidere iwu dị na agba nke 27 (1) nke iwu okporoụzụ na Legọs Steeti nke etiri n'afọ 2015. Ọkaikpe ya bụ okwu dị n'ụlọikpe bụ ji N250,000 na mmadụ abụọ nwere agba naa Olabode n'akambee. Mgbe ọzọ a ga-ekpe ya bụ ikpe bụ na Octoba 30 2018. BBC Igbo kpọtụrụ ndị bụ nna nwekwara ụgbọala ka ha tụnye anyị azụ ihe ise onye na-akwọ ụgbọala kwesiri ịma iji gbochie ụdị ọdachị a. Lee ihe Tony Umeh bụ onye na-arụ egwụ gwara BBC Igbo. Akụkọ ga-amasi gi" afirika-54759314,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54759314,Palm Wine: Ihe isii mere mmanya nkwụ na ngwọ ji dị oke mkpa,E jirila ya gụọ ọtụtụ egwu n'ala Igbo na mpaghara ndị ọzọ n'Afrịka.,"Mmanya ngwọ bụ otu mmanya ndị Igbo anaghị eji egwu egwu. Emume ọbụla ọ sọrọ ya bụrụ, a na-anabata mmanya ngwọ. Emume oge ọọụ dịka ịgba nkwụ nwaanyị, mgbe amụrụ nwa ọhụru maọbu mgbe mmadụ chiri echiechi; mmanya na adịkarị. Ma ọbụladị mgbe a na-eru uju, ndị Igbo na aṅụ kwa ya bụ mmanya iji kasie obi. Mmanya ngwọ ọbara uru maka ahụike? E nwere akụko dị iche iche maka etu mmanya ngwọ sị edozi ahụ mana ọtụtụ amaghị ma sayensi akwadoro akụko ndị a. Ịmaara ka Nkwụ si agba mmanya? Iji maa atụ bụ n'akwụkwọ ""Things fall apart"" nwaafọ Igbo bụ Chinua Achebe dere, o gosiri na mmanya ngwọ bụ ihe n'ọgbakọ ndị ichie dịka ha si ka onye ntoroọbịa ka lụrụ nwaanyị ahụrụ ṅụọ ya ike mmanya maka na ọ na-enyere aka ịtụwa nwaanyị ime. Ọtụtụ mkwenye ndịa juputara n'ala Igbo mana akụkọ a ga-agwa gị nke sayensi kwadoro. Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma Anyị kpọturu Harrison Omonhinmin na Collins Akanno bụ ndị ọkaibe na agụmagụ ihe nrị na-enye n'ahụ nke bụ Dietician n'okwu Bekee ka ha kọwara anyị nkeọma uru mmanya ngwọ bara n'ahụike mmadụ. Mmanya ngwọ na-enye aka maka ịhụ ụzọ nke ọma Collins Akanno bụ ọkaibe n'ihe gbasara nrị na ahụike ma bụrụ ọgwa oji ego achụ ego kwuru na mmanya ngwọ nwere ụfọdụ ihe ndị na-edozi ahụ nke gụnyere vịtamin A, vịtamin B na C. 'Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri' Akano kọwara na ihe ndị a na-egbochi anụ ahụ na-elekọta mmegharị anya sie ike nke ọma. O kwukwara na ndozi ahụ Potassium dịkwa na mmnaya ngwọ nke na-ahụ na anay mmiri juputara n'anya mmadụ nke ọma nke na-akwụsị anya mmadụ ịgba tịkọtịkọ. Ọ naghị ebuli shuga dị n'ọbara Harrison Omonhinmin kwuru sị "" n'agbanyeghị na mmanya ngwọ nwere shụga, ọ naghi ebuli shuga dị n'ahụ ndi mmadụ elu dịka mmanya ndị ọzọ. O kwuru na nke a mere ka mmanya ngwọ bụru ezigbo mmanya maka ndị na-arịa ọrịa shuga karịa nke dịka mmnaya coke nke ga-ebuli shụga dị n'ọbara mmadụ elu. Mmanya ngwọ na-enye ike Harrison Omonhinmin kọwara na mmanya ngwọ nwere mgbadouem bụ carbohydrates na okwu bekee. Mgbadoume a si na mmanya ngwọ so na ihe na-enye mmadụ ike. Ọ na-edozi obi Akanno kwuru na odoma bụ potassium juputara na palmwine na-edozi mkpụrụobi. Ọ kọwara na ọ na-eme ka mkpụrụ obi na-arụ ọrụ etu o kwesiri ma mee ka ududu na uru ahụ na enyere obi aka sie ike. Nke a na-egbochi ọbara mgbalị elu. Mmanya ngwọ na-edozi anụ ahụ mmadụ Collins Akanno kwuru na mmanya ngwọ na-edozi anụ ahụ mmadụ. Akanno kọwara na ọ bụ odoma, zịnk na magnezium dị na mmanya ngwọ na-edozi ahụ mmadụ. Mmanya ngwọ na ọrịa kansa Ndị nyocha ka na-achọ ụzọ esi agwọ ọrịa Kansa Akanno kwuru na mmnaya ngwọ nwere Antioxidants nke na-egbochi ihe ndị na-ebute ọrịa kansa bụ Free Radicals nke na-egbu seel mmadụ. Nke a mere na mmanya ngwọ di mma maka igbochi ọria kansa. International Cancer Day: ""Chineke zọpụtara m n'aka ọrịa kansa"" - Anwuli Ojogwu Akanno mara atụ si na vịtamin B2 nke bụ Riboflavin na-akwado glutathione nke na-egbochi ihe ndị na-ebute ọrịa kansa. Ụfọdụ ajụjụ ndi mmadu na-ajụ maka mmanya ngwọ Mmanya ngwọ ọ na-ebute mmiri ara ịgba nke ọma? Dịka ndị ọkammụta ahuike siri kọwa, ara bụ ezi nri na-eme ka ụbụrụ ụmụaka na-acha ọkụ Omonhinmin kwuru sị na-agbanyeghị na enweghị ọtụtụ nnyocha emere maka mmanya ngwọ. Kama o kwuru na ọdịghị mma ka nwaanyị di ime ṅụọ mmanya ngwọ n'ihi na mmnya ngwọ nwere shụga nke nwereike ịgbanwe n'ime awa iri na abụọ bụru mmanya na-aba n'anya. Ihe nwaanyi na-arụ ọrụ ma nọdụ n'ọmụgwọ na-agabiga O kwuru na enweghị nycoha na-akwado na mmanya ngwọ na-enyere aka ka ara nwaanyi gbaa mmiri. Ugboro ole ka mmadụ kwesiri ịṅụ mmanya ngwọ n'ụbọchị? Omonhinmin kwuru na dịka mmanya ngwọ na-adị mma n'ahụ, na ọkpataghị na mmadụ ga-aṅụ ya ma ṅụ fee ya oke. O kwuru sị "" Ọ ka mma ka ụmụ nwaanyị nụo otu iko mmanya ngwọ kwa ụbọchị ebe ụmu nwoke nwereike ịṅụ ihe dịka iko abụo kwa ụbọchị. Mmanya ngwọ ọ na-ebute ọrịa ọnya afọ (Ulcer) Collins Akanno kwuru sị na n'agbanyeghị na mmanya ngwọ nwere alkọhọl ruru passenti 5, na ọ naghị ebute ọrịa ọnya afọ." afirika-46368741,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46368741,Okorocha: Aga m akwado ọgọ m ma ọ gaa pati ọzọ,Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha egosila na obi adịghị ya mma na ọgọ ya bụ Uche Nwosu enwetaghị ikike pati APC ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.,"Aga m akwado ọgọ ma ọ ga pati ọzọ Na mkparitaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Owere ụbọchị Tuzde, Okorcha gwara Uche Nwosu na ndị ọzọ obi adịghị mma n' APC Imo ka ha tinye isi ebe masiri ha ma kwe nkwa ịkwado ha. ""Ihe ga-eme bụ na ha gawa ebe ọzọ ịchụ ebumnobi ha ebe masịrị ha, aga m anọgide na APC ma kwado ha. "" Nwosu na mmadụ karịrị 20 ndị zọrọ maka iweta ikike ịnọchịte anya mpaghara ha n'ụlọomeiwu nke steeti ahụ n'aha pati APC gba aka efu. Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ: Ọ bụ na nzọpụ ụkwụ a Okorocha na-azọpụ agaghị ememila otito APC n'Ala Igbo? Ọ bụ na ọ gaghị emetụta onyeisiala Buhari inweta vootu n'Imo steeti nakwa ala Igbo niile na 2018? Nke a bụ n'ihi na Okorocha bụ onye wetara pati APC na steeti ahụ. Nke ọzọ bụ na ọ bụ Okorocha bụ naanị gọvanọ APC nwere n'ala Igbo. Na nkọwa ya , otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Nnamdị Okenwa kwuru na mkpebi Okorocha ga-ebute mgbanwe. 'Ihe ọ ga-agbanwe riri nne."" Mana Okenwa, onye bụ onyenkuzi na mahadum, Enugu State University, dọrọ aka na ntị na nzọpụ ụkwụ ahụ nwere ike ịda aka nri maọbụ aka eke. ""Onye APC họrọ nwere ike nwe mmeri maọbụ Uche Nwosu enwe na pati ọ ga-aga. "" 'APC na pati ha ga-aga ga-enwe nkwekọrịta' N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru APC na steeti ahụ bụ Jones Onwusoanya, kwuru na ''APC ga-enwe nsogbu n' Imo steeti na Ọwụwa-anyanwu niile. ""Ọ bụ Rochas wetara APC na Imo steeti' ma bụrụkwa onye pati ahụ na steeti ahụ na akwado. Ọ gara n'ihu kwuo na pati ọbụla Uche Nwosu ga-aga, APC na pati ahụ ga-enwe nkwekọrịta (alliance). ""Ha agaghị enwe onye ga-azọ ọkwa onyeisiala kama ha ga-atụnyere Buhari na 2019."" 'Ọ bụghị naanị Rochas wetara APC n'ala Igbo' Mana ndị otu APC agbadoghị Okorocha kwuru na nkwado Rochas ga-enye pati ọzọ enweghị ihe ọ pụtara APC. Otu onye n'ime ha bụ Toe Ekechi gwara onyentaakụkọ BBC na o nwere ndị soo Rochas were webata APC n' Imo dịka Osita Izunaso, na ndị isi pati ahụ na steeti dịga n'ala Igbo. Ekechi kwuru na ọnọdụ APC ga-aka njọ ma Okorocha nọrọ na pati karịa ma ọ bụrụ na ọ pụọ maọbụ nye ọgọ ya nkwado na pati ọzọ. ""Rochas emela ọtụtụ ihe na-ewe ndị Imo,Ndigbo iwe, ha were na-eche na APC bụ pati ọjọọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48701335,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48701335,Child Trafficking: Ichi egburu nwata a n'ihu zọrọ ya n'aka onye ntọrị,"Ndị uweojii si ngalaba ""Special Anti Robbery Squad (SARS) nwụchịrị otu nwaanyi aha ya bụ Queen Imoh ka ọ gara ịrị̄ nwatakịrị n'obodo Umuna nke Orlu, Imo steeti.","Queen Imoh, bụ onye uweojii si na ọ bụ onye mba Kameron, zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Adbulwahab na mpaghara Nassarawa dị Kaduna, isi obodo Kaduna steeti. Akwụkwọ ozi sị n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Godson Ikeokwu sị na ọ bụ ndị mmadụ hụrụ Imoh na nwata ahụ wee che na ọgaghị abụ nne ya gbaara ndị uweojii ama. Ndị uweojii sị na nna nwata ahụ atọrọ a bịala kpọrọ ya Ndị uweojii sị na Imoh kwenyere na ya zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Abdulwahab ma kwukwa na ọbụghị mbụ ya kpara ụdịrị ike a. Dịka ndị uweojii siri dee, Imoh gwara ha na ya rere nwa ya aha ya bụ Joseph Imoh dị afọ abụọ pụtụ naịra narị abụọ. Ndị uweojii sị na Queen Imoh kwere na ya mere ihe a sị na o mere Ọ sịkwa na ya rere nwata aha ya bụ Samuel M dị otu afọ puku naira narị abụọ na iri atọ. Ọ sị na ya zuru nwata nke a mgbe nne ya si ya nedo ya anya. Godson Ikeokwu dere na ọ bụ ndị Awụsa nọ n'Orlu nyere aka chọta nne na nna Naziru ma hụ na o ruru ha aka. Imoh ka nọ n'aka ndi uweojii. Ntọrị ụmụaka bụ ihe na-eme kwamgbe na Naịjịrịa, ọkachasị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Lee ihe nkiri anyị maka ntọrị ụmụaka: Kidnapping in Nigeria: 'E gburu ndị atọrọ mụ na ha mana Chineke zọrọ m ndụ'" afirika-46272853,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46272853,#NextLevel: Ọ bụ ezie na APC kọpịrị ihe onye ọzọ mere?,"Onyeisi mgbasaozi maka achụmnta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari, bụ Festus Keyamo ekwuola na ebubo na e zuru akara ""NextLevel"" ezu bụ ụgha.","Ebubo izu akara njirimara na-eso nwepụta nkwa Buhari maka achụnta vootu Ihe na-akpọtụ na soshal midia nakwa intanet n'ụtụtụ Tuzde bụ ebubo na onyeisiala Muhammadu Buhari na otu APC kọpịrị akara njirimara ụlọakwụkwọ n'mahadum dị na mba Amerịka were mee akara ozi ịchụnta vootu ya. Ụbọchị Ụka, onyeisiala Buhari wepụtara nkwa ihe ọ ga-emere ụmụ Naijiria ma ọbụrụ na ha tụnyere ya n'afọ maka ntuliaka 2019. Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere n'ekwenti Keyamo kwuru na ebubo ahụ sị n'aka otu PDP bụ nkata ndị iro kpara iji kwere ha ọnya. ""Ọ bụghị ezi okwu. Anyị nwere nke bụ nke anyị. Nke a bụ mpụ nke ndị na-akwado PDP na-akpa. Njirimara nke ọzọ bụ akpụrụ akpụ nke ndị na-akwado otu PDP kpụrụ."" Mana dịka ndị otu APC na-agosikwa ike na nkata ahụ bụ aka ọrụ ndị iro ha, nyocha BBC Igbo mere gosiri na onyeisiala Buhari na ọtụtụ ndịọrụ ha tinyere akara ahụ n'igwe okwu ha na soshal midia. Ojeozi mgbasaozi Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad jiri akara ahụ nke ha kwuru n' ọbụghị nke ha zipu ozi. Ndi kwe na ndị ekweghị Ebubo etinyela ịkọ ọnụ na-etiti ndị na akwado APC nakwa ndị na-akwado PDP" afirika-57124046,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57124046,"Abaribe: Biafra m na-ele anya ya bụ nke mmụọ, ọ bụghị nke ala - Abaribe",Onye omeiwu na-anọchite Abia South n'Ụlọomeiwu Ukwu bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ihe ọ chọrọ bụ Naijiria ebe mpaghara ọbụla ga-achọ mmepe ka o siri masị ha.,"Abaribe kwuru nke a n'izu a n'ọgbakọ nke ndị ọkaiwu ngalaba nke Ọka nwere n'Ọka Anambara steeti, na ""E kwube okwu nhazigharị Naijiria, ndị omeiwu ndị ugwu asị, ọ bụ na ka i were nweta Biafra? ""N'ezie achọrọ m Biafra, mana Biafra m chọrọ bụ Biafra nke mmụọ, ọ bụghị nke ala."" ""Ndị rue ha mepewe mpaghara nke ha."" Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. ""Anyị nọ n'Ọwụwa Anyanwụ nwere ike bụrụ mpaghara kachasị nwee ego site n'ike ọrụ ha ma a hazigharịa Naijiria."" ""Echeghị m na anyị ga-enweta ihe anyị chọọ site n'ọgbaghara."" Abaribe katọrọ ogbugbu a na-egbusisị ndị uweojii na ịgba ogige ha ọkụ n'Ọwụwa Anyanwụ sị na ọ bụ arụ kwọ nwa. ""Anyị nwere ike inweta ihe anyị chọrọ site na ime ihe dị mkpa ka e mee, nke bụ isonye naa nhazigharị Iwu Naijiria."" ""Ọ ka mma ka anyị mee ka Naijiria dị mma obibi kama ịkwafu ọbara kwa ụbọchị."" ""Ọ bụrụ na ihe anaghị aga ọfụma, aga enwe ndị na-eti mkpu"" Abaribe onye kwuru na ọchịchị Buhari gbakụtara 'Iwu Naijiria dịka o siri metụta 'Federal Character' azụ, nke o kwuru so bute ihe na-afịọ ugbua na Naijiria. ""Dịka anyị na-ekweta na ọ dị mkpa ihazigharị ala anyị, anyị kwesịrị ikweta na ihe butere nsogbu na-afịọ ugbua anyị bụ emeghị onye ka e mere ibe ya nke gọọmentị nọ n'ọkwa ugbua.""" afirika-44274364,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44274364,Akụkọ kachasị n'abalị a: Salah ọ ga-aga iko mbaụwa?,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Mo Salah tụnyere aka ya na-mmeri emeriri ha ụnyahụ,"Ị ma na Iko mbaụwa afọ a nwere ike ịcha Mohammed Salah? Onye nlekọta otu egwu bọọlụ Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na mmerụ ahụ Mohamed Salah nwere abụghị obere ihe, na ọ dịka ọgbajiri ọkpụkpụ olu ma ọ bụ nku aka. Ndị uweojii adọọla aka na ntị maka ogbunigwe dị n'ala Ebere Amaraizu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti Ndị uweojii akpọkuola ndị ọrụugbo na ndị ọrụụzọ ka ha saa anya miri maka ogbunigwe e liri n'ala oge agha. Ebere Amaraizu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti kpọrọ oku a na mkparita ụka ya na BBC Igbo nwere taa. Onyeisiala Buharị ekwela ụmụaka nkwa taa bụ ụbọchị ha Buharí nyere iwu ka ndí nchekwa na ezinaụlọ lebere ụmụaka anya n'ụzọ pụrụ iche Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ụmụaka n'ụwa nịịle gbaa gburugburu, onyeisiala Buharị akpọkụola ndị nkuzi, ezinaụlọ nakwa ndị ọrụ nchekwa obodo ka ha do do do hụ na ụmụaka nwere ezi nchekwa na Naịjirịa. Onyeisiala kpọrọ okụ a n'ozi ya ebe oha na eze turu anya na ọ ga ekwute maka ụmụaka Chibok fọrọ na Leah Sharibu ka na-efu efu. Akụkọ mba ofesi; Amụma mmiri akwụsịla ndị ụgbọelụ na Britain Ihe dịka amụma mmiri ruru 15,000 sere n'igwe na ọdịda anyanwụ Briten ụnyahụ Oke egbe igwe gbara na Britain unyaahụ emela ka ụgbọelụ ndị kwadoro ime njem taa kwusị njem ha n'ọdọ ụgbọelụ Stansted. Ya bụ egbeigwe tinyekwara okụ n'ebe ụfọdụ nke a sị na ndị na-achụ ọkụ gbanyuru n'isi ụtụtụ taa. Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ụgbụa" afirika-49521169,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49521169,"Rochas Okorocha: Aga m abata Imo mgbe ọbụla m chọrọ, onweghi ihe ga-eme m - Okorocha",Aka chịburu Imo Steeti bu Rochas Okorocha ekwuola na ya ga na-abata Imo Steeti mgbe ọbụla ọ chọrọ.,"Rochas Okorocha Okorocha kwuru na onweghi onye maọbụ ndị ọbụna ga-egbochi ya ịba na steeti ya. O kwuru nke iji zaghachi gọọmentị Emeka Ihedioha bụ nke nyere iwu ka anwụchie Okorocha mgbe ọbụla a hụrụ ụkwụ ya n'ala Imo. N'akwụkwọ ozi onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo zipụrụ n'ehihie Fraidee, Okorocha kwuru na iwu ahụ Ihedioha nyere kụrụ afọ n'ala. O kwuru na ọbụ okwu na ụka ka gọọmentị Ihedioha na-achọ kpatara o ji wee nye iwu dị otu ahụ. ""O gosikwara na Ihedioha na ndị ọrụ ya enweghị nsọpụrụ n'ebe iwu na-achị Naịjirịa dị."" Onwuemeodo kwuru na ọbụ ezie na Okorocha bizi n'Abuja ugbua, ọgaghị egbochi ya ịbata Imo Steeti mgbe ọbụla ọ chọrọ. Ọ kpọrọ ụmụ Naịjiri ndị ihe ọma na-adị mma ka ha ghara ịtụ uche n'ihe gbasara i Emeka Ihedioha, gọvanọ Imo steeti BBC Igbo kọbuuru gị na gọvanọ Emeka Ihedioha nyere ikike ka anwụchie Okorocha ebe ọbụla a hụrụ ya na steeti ahụ. Onye ndụmọdụ Ihedioha n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Steve Osuji gwara BBC Igbo nke n'ụbọchị Fraịde. Osuji kwụrụ na ebe Okorocha bụ nwata na-ekweghi na nne ya ga ehi ụra, ya bụ nwata agaghịkwa ehi ụra nke ya. Osuji gara n'ihu kwuo na nke ahụ bụ ntụziaka gọọmentị Ihedioha nyere n'ihi na Okorocha aghọọla ọkwụrụ na-achọ ịkarị onye kụrụ ya. O kwuru sị: ""Anyi agaghị agba nkịtị ka Okorocha kpata nkwafu ọbara n'Imo steeti tupu anyị e mee ihe maka ya."" ""Okorocha kwesịrị ịghọta na ọnọzighi n'ọchịchị."" ""Anyị agaghịzị ekwe ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị mmadụ ọzọ."" Osuji kwukwara na ntụziaka ahụ Ihedioha nyere emegideghi iwu n'ihi na ọbụ iji wee zọọ ndụ ma gbochie ọgbaaghara. Ọ kọwakwara na ndị uweojii kwadoro ntuziaka ahụ. Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ụmụokorobịa wakporo Jasper Ndubuaku, bụ onyeisioche na-ahụ maka mweghachị akụnaụba gọọmentị Imo Steeti. Ndubuaku kwuru na ọ bụ ndị otu Okorocha wakporo ya ma merụọ ya ahụ n'ụbọchị Tọọzdee. Ihe onyonyo ebe a wakporo Ndubuaku agbaala kamgbe na soshal midia. Dịka ihe onyoonyoo ahụ siri gosi, ụmụokorobịa ọnụọgụgụ ha buru ibu chụụrụ Ndubuaku chụbaa ya n'ọwa mmiri dọkachaa ya akwa. Lee ihe onyoonyoo ahụ dịka otu a kpọrọ ""Only In Imo State"" siri kee na soshal midia ""Facebook"". Jasper Ndubuaku bu onyeisi ngalaba na-ahu maka ịnakọta akụnaụba gọọmentị ndị mmadụ zuuru n'ohi Ndubuaku si na ọbụ mgbe ọ gara ịnye Sịnatọ Okorocha Okorocha akwụkwọ si ụlọikpe maka akụnaụba ha sị o bụkọọrọ laa be ya, ka ụmụokorobịa ndị ahụ wakporo ya. O kwuru sị: ""Ha jicha ma mma ma okpiri wee wakpo m. Ekele dịrị Chineke na m ka dị ndụ"". Ọ gakwara n'ihu gụpụta ihe dị ndị ha sị na Sịnetọ Okorocha bụkọọra laa. Maazị Ndubuaku sị na ha gunyere ụgboala karịrị iri isii nakwa ụgbọ mmiri anọ na-agbasi ike nke ọ sị na ọbụ ụlọọrụ ""Niger Delta Development Commission"" (NDDC) nyere Imo Steeti. Ọ gakwara n'ihu kwuo na nke ọzọ bụ nnukwu ụgbọala e ji agbanwe ọkụ na-enwu n'okporo ụzọ a kpọrọ ""street lights"" na Bekee. N'otu aka ahụ, ode akwụkwọ Imo Steeti bụ Uche Onyeaguocha, kwuru na ndị Imo niile ga-echebiri Okorocha ma nwụchie ya ngwangwa ọ tụrụ ụkwụ na steeti ahụ. Onyeaguocha kwuru nke a oge ọ na-agwa ọtụtụ ndị mmadụ okwu na ogige ụgbọelu Imo Steeti. O kwuru na ha ga-achụrụ Okorocha gaa ebe ọbụla ọ nọ ma rukwaa n'Ogboko bụ obodo ya. BBC gbara mbo ịkpọ ndị uweojii iji mata ihe ha na-eme iji gbochie nnukwu ọgbaaghara ịdapụta na Imo Steeti. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeoku azaghị ekwentị ya. O zaghaghịkwa ozi anyị zigaara ya. Ihe Okorocha kwuru Sam Onwemeodo, ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha, gwara BBC Igbo na ihe niile Ndubuaku na-ekwu bụ asị asị. N'ime akwụkwọ ozi o ziteere BBC Igbo, Onwemeodo kwuru na Ndubuaku kpọ ụmụokorobia ruru mmadụ 700 wee wakpo ụlọ Okorocha. ""Ọ bụ mgbe ha chọrọ iwakpo ụlọ Okorocha dị na Sipbat ka ndị mmadụ nọ nso ebe ahụ gbatara bị kwụsị ha"". Onwuemeodo kwukwara na onweghi ikike ụlọikpe ọbụla Ndubuaku ji wee bịa ije ahụ. Ọ dọkwara gọvanọ Ihedioha aka na ntị ka ọ hapụ ị na-achụgharị Okorocha, kama ya gbado anya n'ọrụ ọchịchị e nyere ya ka ọ chịa. Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha Cheta na ọbụ Ndubuaku bu onye ndu ndị gara n'ụlọahịa nwa Okorocha bụ Uloma Nwosu ịga bukọrọ ihe ha sị na e zuru ezu. Uloma Nwosu bụkwa nwunye Uche Nwosu bụ onye so dọọ ndọrọndọrọ gọvanọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ""Action Alliance"" (AA). Nwosu rụburu ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ Okorocha oge ọ nọ n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Dora Akunyili: Aka m na-ahụ nwunye m na nrọ" afirika-53988905,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53988905,Life Hacks for pimple: Ihe isii dị n'usekwu gị i nwere ike iji gwọọ 'pimple',"Pịmpụl bụ ọnọdụ mmanụ na akpụkpọ ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ ịkpọchi ohere ajị dị n'ahụ mmadụ, ọkachasị n'ihu, obi, ogbe azụ na ubu.","Ihe na-ebute pịmpụl; ahụ mmadụ na-ewepụta mmanụ rinne, nje na-ebute ọrịa banye mmadụ na-arụ m nke na-emekarị ndị na-etolite etolite. Dịka Dkta Chidinma Okafor bụ dọkịta ahụike ọha ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara akpụkpọahụ si kọwaa, ihe mere pịmpụl ji emekarị n'ebe ndị a bụ na ha bụ akụkụ ahụ nwekarịchara akpa na-emepụta mmanụ n'ahụ nke Bekee kpọrọ ""sebaceous glands"". Pịmpụl na-eme ka akụkụ ahụ ebe ọ metụtara chakarịa maọbụ jikarịa ebe ndị ọzọ. Pịmpụl nwekwara ike ime onye ọbụla n'agbanyeghị afọ ole ọ dị, mana ọ na-emekarị ndị na-abanye okorobịa na agbọghọ. Ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ihe na-ebute pịmpụl gụnyere; ahụ mmadụ na-ewepụta mmanụ rinne, nje na-ebute ọrịa banye mmadụ na-ahụ, na iri nri nwere oke mmanụ na shuga. Dkta Okafor kwuru na mgbanwe mmiri ahụ mmadụ na ihe ọnọdụ pụrụ iche dịka ime, nsọ nwaanyị, ịbanye oge okoro na agbọghọ nwere ike ibute pịmpụl maọbụ mee ka ọ kawanye njọ. Ihe ọzọ nwereike ịgbanye mmanụ n'ọkụ na-enwu enwu dịka o siri kọwaa bụ ""kemịkal na-eṅomi mmiriahu a kpọrọ 'estrogen' ịbanye mmadụ n'ahụ site na nri, ọgwụ, mmiri, ude maọbụ atịtị si na gburugburu."" O kwuru na 'estrogen' na-ebute mmụba mkpụrụ ndụ (cell) mara abụba n'ahụ. Ihe ndị dị n'usekwu gị nwereike igboro gị maọbụ nwa gị ọgụ pịmpụl: Dọkịta Okafor kọwara na mmadụ inwe ezigbo akpụkpọ ahụ bụ pasentị 75 ihe oriri eri ebe naanị pasent 25 bụ ihe o tere ete, ya mere ọ ji dị mkpa itinye anya n'ihe ị na-eri iji gbalahụ nsogbu pịmpụl. Dọkịta Uche nyere ndụmọdụ ka ị zere ụfọdụ nri ma tinye uchu na iri ụfọdụ ndị ọzọ. Ụfọdụ nri nwere ike ime pịmple gụnyere pasta, chim-chin, meatpie, na ụfọdụ nri ndị ọcha dị na komkom n'ihi na ha na-enwe oke mmanụ. Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ n'usekwu gị nwere ike igboro gị maọbụ nwa gị ọgụ pịmpụl: 1. Mmanụ 'black seed oil' E kwuo okwu iji mmanụ 'black seed oil' agwọ pịmpụl, ọ ga-adị ka iji agbara agwọ ọjọ mana dịka ndị o doro anya si kwuo, mmanụ 'black seed oil' bụ ezi mmanụ na-agbara pịmpụl ụgbọ nwa mkpi dịka ọ na- egbu nje na-ebute ya. ""Ọ bụrụ na ị na ị ṅụọ ma teekwa ya ete, ọ ga-ebupuru gị pịmpụl ma mee ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ."" ""Black seed oil nwere 'zinc', 'linoleic acid nke bu 'Omega 6' pasentị 55.6 ma nwekwa - Oleic Acid nke bu 'Omega 9' pasentị 22.6."" Dkta Okafor nyere ndụmọdụ ka ị ghara ite nnukwu kama rụrụ mmanụ ahụ kpọmkpọm atọ maọbụ anọ, were nwayọọ terụọ ya n'ahụ. Ṅụkwa otu ngazị nwa mmanụ ahụ kwa ụbọchị. 2.Osikapa ndị Igbo (Brown rice) Dkta Uchendu bụ ọkachamara n'ihe gbasara nri na etu o si enyere ndụ aka na mahadum 'National Open University of Nigeria' (NOUN) si kwuo, ọ dị mkpa ị na-eri osikapa a kpụchaghị akpụcha ma hapụ nke a kpụchara akpụcha (polished rice). Osikapa a kpụchaghị akpụcha bụ osikapa ndị Igbo, dịka osikapa Abakaliki, Nsụka, Adanị dgz. ""Ha nwere ihe na-amịcha mmanụ n'arụ ma ọbụrụ na i rie ha."" Agwa Lekwa etu agwa na anụ ọkụkọ siri dị ka di na nwunye Dịka ọkammụta Florence Uchendu si kọwaa, nri dị ka agwa na nri ndị ọzọ nọ n'ezinaụlọ ahụ dịka akịdị, fịọfịọ na 'soyabeans', na-egbu pịmpụl. ""Ha nwere 'zinc'. Nri nwere 'zinc' na-eme ka ohere dị n'ahụ(akpụkpọ ahụ) ghara imechi."" Ọ kọwakwara na nri nwere zinc na-enwekwa akụrụngwa Bekee kpọrọ 'Niacin' na 'Pantothenic acid' na-edozi ahụ ma mee ka ohere dị n'akpụkpọahụ ghere oghe. Uchendu dụrụ ọdụ ka ndị nwere pịmpụl na-agbalị iri agwa maọbụ nri yiri ya o pekata mpe miligram iri anọ (40 miligram) n'ụbọchị. Gee ihe Dkta Florence Uchendu kwuru n'uju ebe a: 'Agwa na nri ndị ọzọ e ji agwọ 'pimple' 4. Mmanụaṅụ Ama m na ị ma na ndị na-asọ shuga na-eji mmanụ aṅụ edochi ya maka inweta ọnụ ụtọ na nri ha, mana ị ma na mmanụaṅụ bụ ọkpọka maka ịgwọ pịmpụl? Dọkịta Okafor kwuru na ""mmanụaṅụ nwere 'oligosaccharides' nke na-enye aka ikwado mmụba ezigbo nje n'akpụkpọahụ."" Ite ya n'ihu ga-alụrụ gị ọgụ pịmpụl n'ụzọ pụrụ iche. 5. Ajaụpa I so na ndị na-achọ ihe dị n'ala n'uko elu? Anya ruo gị ala! I nwere ike ịgwọ pịmpụl site na-ịgwọ aja ụpa, ajaụrọ maọbụ ajanzu, tee ya n'ihu, hapụ ya nwa oge ma sachapụ ya. Dkta Okafor kọwara na ""aja ụpa nwere ike pụrụ iche (electromagnetic charges) ịdọpụta atịtị dị n'akpụkpọahụ."" O kwukwara na ụfọdụ ajaụpa dịka 'bentonite clay' na 'kaolin clay' nwereike ime ka mmadụ nwuwanye ọcha. 6. Akwụkwọ nri na mkpụrụosisi Dịka Uchendu, onye bụ onyeisi ngalaba ahụike ọha na mahadum NOUN kwuru na akwụkwọnri dịka ụgụ, inine, karọt, tomato (dgz) na mkpụrụosisi dịka ụtụ, ọkwụrụ ezi, oroma, ụkpa (dgz) nwere 'Vitamin A' nakwa'antioxidant na-enyere akpụkpọahụ aka ịkwọ mụrụmụrụ. O kwukwara na iri anụ torotoro nakwa azụ nwere mmanụ na-adịkwa mma maka ịgwọ pịmpụl. Ụdị nri nwereike ibutere gị pịmpụl ị kwesịrị ịgbara ọsọ Dịka Uchendu si kọwaa, nri komkom nke Bekee kpọrọ 'canned food' nwere oke abụba ọjọọ (satụrated fat), flọ nakwa shuga nwere ike ịbọlite pimpụl. Ya mere, sere aka gị na nri ndị a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44615285,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44615285,Kedụ ka nne a siri gbuo naanị nwa nwoke o nwere?,"Ndị uweojii n'Ụmụahịa Abịa steeti anwụchiela otu nwaanyị gbara nwa ya nwoke ọkụ maka ""Memory Card"" ekwentị furu efu.","End of Twitter post, 1 A na-ekwu na nwa ahụ aha ya bụ Odum Prince gbara afọ iri na abụọ. E bugara ya ụlọọgwụ gọọmenti etiti dị n'Ụmụahịa ụnyaahụ mana ọ nwụrụ n'elekere ise nke ụtụtụ taa. Onye nkwuchiteọnụ ụlọọgwụ ahụ bụ Darlington Mmadubuko kwuru na ọkụ ahụ gbara nwantakịrị ahụ nke ukwu nke mere na ọ nataghị ọgwụgwọ. Ndị uweojii kwetere na ihe a mere ma kwuo na ha anwụchiela nwaanyị ahụ. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ihe ahụ mere n'Amuzukwu Ibeku n'Ụmụahịa. N'okwu ya; ""Anụrụ m na ọ bụ maka kaadị ahụ furu efu mere nwaanyị ahụ jiri kechie nwa ya aka, wụọ mmanụ ọkụ wee munye ya ọkụ."" Akụkọ na-ebo ebubo na nwa ahụ zuru ya bụ kaadị mana ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nyocha ihe mere. Tescool kwuru maka ọnwụ nwa hụ n'igwe okwu twitter. N'akụkụ nke ya, I am Freddy One kwuru na nne nwa ahụ wụrụ ya mmanụ ọkụ we munye ya ọkụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43166704,https://www.bbc.com/igbo/43166704,2019: Buhari ekwuola na ya ekpebibeghị ịzọ ọchịchị,Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru nke a na nzụkọ ya na ndị Gọvanọ APC nwere n'abalị ụnyaahụ.,Buhari ga-agwa ndị Naịjiria niile ma o kpebie ị zọ ọchịchị Isi okwu nzụkọ ahụ bụ ịkwado Buhari ka ọ ga-niru zọọ ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2019 na-abịa. Buhari sara ndị Gọvanọ ahụ si ha nye ya oge zuru oke ka ya nwe ike kpebie n'ime onwe ya tupu o kwuputa ebumnuche ya maka ntuliaka ahụ. Onyeisi ndị otu Gọvanọ ahụ bụ Rochas Okorocha gwara ndị ntaakụkọ na ha kpakọrịtara maka ihe dị ịcheịche metụtara ala Naịjiria ọkachasị ọnọdụ pati ha na ọzụzọ ọchịchị Buhari. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Okorocha kwuru na ọ ga-amasị ndị Gọvanọ ahụ ma ọ bụrụ na Buhari zọọ ọchịchị n'ihi na ọ na-eme ọfụma. Nke a bụ ugboro abụọ Buhari na ndị Gọvanọ APC na-enwe nzụkọ n'ime otu izuụka. afirika-44051540,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44051540,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: APC Ekiti ahọpụtala ụbọchị mmegharị ntuliaka imeụlọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"E tinyela ụbọchị ọhụrụ maka ị me ntuliaka imeụlọ nke APC n'Ekiti steeti nke akagburu akagbu. Ndị isi pati APC họrọ ụbọchị iri n'otu nke ọnwa Mee (May 11) ka ha mechara nzụkọ gbatagbata maka ọgbaaghara mere na ntụliaka nke ha mere na Satode gaara aga. Ebola alaghachitela ọzọ WHO kwupụtara na mmadụ abụọ bu ọrịa ahụ, ebe mmadụ 17 nwụrụla díka a na-eche na ọrịa ahụ bidoro ọzọ na Bikoro dị na mba ahụ. Ndị uweojii anwụchiela otu abụọ ha kwuru na-azụ ahịa egbe na Benue steeti Ndị uweojii bokwara ndị a ruru iri n'otu ebubo na ha na-ebunye ndị ntọ na ndị omekome egbe ha jị arụ ọrụ mwakpo ndị mmadụ. Ha chọtara mgbọ, egbe dị icheiche na ngwa ọgụ ndị ọzọ ndị a bu agagharị. Emzor ekwuola nke bụ ezie maka akụkọ NAFDAC ịkpọchị ụlọọrụ ha ...Ebe sinetọ akpọrọ Shehu Sani katọrọ ihe a ndị NAFDAC mere n'elu soshal midia Twitter: FIFA adaala Russia nha maka egwu ịkpa oke agbụrụ. FIFA dara mba Russia nha puku pounds iri abụọ na abụọ(22,000GBP) maka egwu ịkpa oke agbụrụ ndị na-akwado ha na-agụ mgbe otu France na Russia gbara bọọlụ n'ọnwa Maachị. Paul Pogba, Ousmane Dembele and N'Golo Kante ndị ọgba bọọlụ mba France bụ ihe ndị a metụtara. Ha kwuru na ha a gaghị enye otu ọbụla ohere ịkpa oke agbụrụ n'asọmpị iko mbaụwa n'abịa chaachaa. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Gọvanọ Umahi sị sị kpụta Charles Ogbu, gini ka omere?" egwuregwu-43446710,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43446710,Iko FA: Lukaku na Matic nyere United mmeri,Romelu Lukaku nyere goal nke 12 ya na asọmpị 11 nke ọ gbara na Iko FA ka Manchester United gbagburu Brighton jiri were ruo agba nke ọkara na ya bụ asọmụmpị.,"Lukaku na ndị United ọzọ na ele anya na ya ka nwere ike gba Champions league n'afọ ọzọ Lukaku jiri isi kunye goolu nke mbụ ka Nemanja Matic gbapuru ya boolu na agba nke mbụ na asọmpị ahu. Matic na onwe ya mechara nweta goolu nke ya mgbe ọ jikwara isi nata bọọlu Ashley Young gbaara were tinye ya n'ime goolu. Mmeri a United wetara ga-enye ha ikike ijiri chụwa ịlaghachị Champions League nke afo na-abịa ka Sevilla gbapụrụ ha na nke afọ a. Agbanyeghị na United eribeghị goolu na Iko FA nke afọ a, ukwu jiri ha ụnyahụ nke mere ka ha gba ka ndi si na ụra tete. Na agba nke abụọ n'asọmpị ahụ Brighton nwetara ọtụtụ ohere inye goolu nke ha tupu goolu Matic mechie akwụkwọ. Mourinho, bụ onyendu United sịrị na ya na ""ata onyeobụla uta"", sịkwa na ndị otu ya nọ na 'atụ egwu' ịgba bọolu etu okwesiri. Ndị kwu United na azụ, bụ ndi ka na-ewe iwe maka mmeri Sevilla meriri ha, zịkọkwara iwe ha ka a nọ n'ime ya bụ egwuregwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44180633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44180633,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Ndị mmadụ rahụrụ n'ezi taa amaka Markle,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Taa bụ ụbọchị a karaaka n ' isi Prince Harry na Meghan Markle,"Meghan Markle gbara afọ 36 ebe dị ya gbara afọ 33 Nwa nwa Queen Elizabeth bụ Prince Harry na Meghan Markle chọrọ Igba akwụkwọ n'ụlọụka St. George na Windsor tata. Fashola sị n'inyi juru na be anyị Babatunde Fashola bụ minista na ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ Minista na-ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka etu ha si na-awụfụ ahịhịa n'ọkporoụzọ. Fashola Kwuru nke a ka ọ gara nyochaa ọrụ gọọmentị na-arụ n'Abia steetị, bụ ebe o kwuru na nwufu ahịhịa n'okporoụzọ bụ ihe juru ya anya site Okigwe ruo Lokpanta. Ugboelu kuriri na Cuba Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri Ndị nyocha naha etinye anya n'ihe kpatara ụgbọelu jiri kurie ụnyaahụ n'akụkụ isi obodo Cuba bụ Havana. Isi mmadụ dị otu narị na isii (106) lara ebe mmadụ atụ pụtara na ya bụ ihe mberede. Miyatti Allah dọrọ Gọvanọ Ortom aka na ntị Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri Ndị na-anọchite anya ndị Fulani na-achị ehi na Naịjirịa bụ Miyetti Allah, akpọọla onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ dọọ aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom aka na ntị. Ortom hibere iwu imachi ndị ọchịehi ịchịgharị ehi ha na gburugburu steeti ahụ. Ndị Miyetti kwuru na ha ga-eme ihe niile n'usoro iwu ịhụ na egbochighi ha ibi ndụ etu ha si ebi. Gee nkeji nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Ara m bụ oke ibu arụ nye m" 45536672,https://www.bbc.com/igbo/45536672,Ipob: Kpọpụtanụ Nnamdi Kanu - Ọkaiwu ya,Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu onyeisi ndị otu Ipob na-efu efu bụ Nnamdi Kanu akpọkuola ndị agha Naịjirịa ka ha kpọpụa Kanu ebe ha ji ya.,"Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Oku a na-abịa ka o mere otu afọ Kanu furu ka ndị agha Naịjirịa wakposiri ụlọ ya dị n'Afaraukwu n'Abia steeti ụbọchị Sepụemba 14, 2017. N'akwụkwọ Ejiofor dere, o kwuru na Kanu kpọrọ ya n'abalị ụbọchị ahụ ndị agha wakporo be ya ma kpọkwa oku ka otu mbaụea dị icheiche lebaa anya n'okwu ahụ ma hụ na a kpọpụara Maazi Kanu ma mee nyocha banyere arụ megide mmadụ. Cheta na ndị agha Naịjirịa kporo ndịagha gaa mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'ọnwa Sepụemba afọ 2017, n'agha ha kpọrọ 'Egwu Eke', iji kwụsị ndị otu Ipob na-eme ngaghrị iwe ka e kewaa Naịjirịa. N'oge agha ahụ, ndị agha wakporo ụlọ Nnamdi kanu bụ onye e nyeburu nwereonwe site na 'bail' ebe a na-ekpebu ya ikpe maka arụ megiere ala. Mana ọkwaikpe Binata Nyakobụ onye na-ekpe ikpe Kanu kpere ikpe n'ọnwa Jenuwarị afọ a na o nweghi ihe na-egosi na ndị agha Naịjirịa ji Nnamdi kanu. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Agbanyeghi ikpe ahụ n'akwụkwọ ozi ahụ Ejioforo wepụtara iji cheta ndị nwụrụ oge mwakpo ndị agha ahụ, Ejiofor kwuru na nkata ikpeazụ ya na Kanu kpara bụ oge ndị agha ahụ nọ n'ụlọ ya. N'okwu, Kanu gwara ya ""Ejiofor, e gbojibidoro ụlọ m, ndị agha na-abata n'ike, na-agba egbe n'ihe niile ha na-ahụ, ị na-anụ olu egbe ahụ, biko gwaa ndị ụwa maka ihe a mere n'ụlọ m. ""Ana m ahụ site n'ime ụlọ na ha agbatuola ọtụtụ ndị otu m nọ n'ala dịka ha na-abata n'ime ụlọ m, ndụ m enweghizi nchekwa, gwa gọọmenti Briten na nke ndị Amerịka na ụwa niile na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa ka a ga-ejide ma ihe ọbụla mee m."" Site na nkata a, Ejiofor na-agbadosi ụkwụ ike na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa ji Kanu mana gọọmenti Naịjirịa ugboro ugboro ekwuola na ha ejighi ya. Ejiofor kpọrọ ka ụwa niile tinye ọnụ n'okwu a dịka a na-eme ncheta maka ndị nwụrụ n'oge ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51941038,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51941038,National Emergency toll line: Gọọmenti etiti ewepụtala ekwentị 112 maka ihe mberede ọbụla,"Dị ka nke a na-eme, Onyeisiala Muhammadụ Buhari emepeela ogige ekwenti gbata gbata nke akpọro National Emergency toll free na Bekee.","Ị ga-akpọ ya bụ akara ekwenti bụ 112 n'efu mgbe ọbụla. End of Twitter post, 1 Minista ahuike bụ Osagie Ehanire na Mịnịsta nta na-ahụ maka ahụike bụ Olorunimbe Mamora Akụkọ na-erụ anyị ndị na-ekwu na ọrịa Coronavirus efeela mmadụ anọ ọzọ na Legọs. Kọmịshọna na-ahụ maka okwu ahụike bụ ọkammụta Akin Abayomi bụ onye kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere ụbọchị Tọzde. Nke a na-eme ya mmadụ iri na-abụọ(12) buterela ọrịa ahụ. Cheta na ụbọchị Fraide ọ pụtara ihe na mmadụ ise ọhụrụ gụnyere nwa e ku n'aka ebutela ọrịa ahụ. Ụlọikpe mkpegharị enyeela Ifeanyi Uba mmeri Ifeanyi Uba Ụlọikpe Mkpegharị dị na-abụja ekpebiela na ọ bụ Ifeanyị Uba nke otu Pati YPP meriri na ntuliaka ọkwa Sinetọ na-anọchi Anambra-South. Ụlọikpe kwuru na nke a bụ n'ihi na ụlọikpe e wegaburu okwu ahụ enweghị ikike ikpe ya. Ha kwukwara na akwụkwọ a gbara ezughị oke ọkaiwu ebinyeghị ya aka nakwa enyeghị Ụba ohere ikwu ọnụ ya(fair hearing). Cheta na ụlọikpe chụtuburu Uba n'oche Senetọ maka ebubo iji asambodo adịgboroja zọọ ọchịchị. Anambra steeti na-atule atụmatụ ha ga-eso iji gbochie Coronavirus Gọvanọ Anambra bụ Willie Obiano Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha na-atule atụmatụ ha ga-agbaso iji gbochie ọrịa coronavirus ịbata na steeti ahụ. Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasa ozi nke Anambra kwuru na ha ga-ewepụta ya bụ atụmatụ n'oge eteghi aka. Adinuba kwuru nke a dịka akụkọ na-efesa na Anambra steeti amachiela ọgbakọ ọha mmadụ n'ihi coronavirus. O kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu n'ihi na gọọmentị ekpebibeghị ihe ha ga-eme. Coronavirus erubeghi nke imechi ụka - CAN Legọs Ndị isi CAN nke Legọs steeti Ndị otu 'Christian Association of Nigeria' nke Legọs steeti ekwuola na ọrịa coronavirus na Naịjirịa erubeghi nke ịmachi ụlọụka. Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde. Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị Onyeisi otu a bụ Alexander Bamgbola kwuru na kama ịmachị ụlọụka dị icheiche, ndị isi ụlọụka ga-agba mbọ ịhụ na ha dobere ihe niile ga-enye aka igbochi ọrịa ahụ n'ụlọụka ha. Nke a na-abịa dịka gọọmentị Legọs steeti machiri ọgbakọ okpukperechi ọbụla karịrị mmadụ iri ise. Bamgbola kwuru sị: ""Anyị nwere olileanya na ọrịa a agaghị eru nke na ụlọụka niile ga-emechi."" Ọ bụ eziokwu na mba Yurop ụfọdụ amachiela ịka ụka nakwa ọgbakọ okpukperechi mana Bamgbola kwuru na ""Chineke agaghị ekwe ka o ruo etu ahụ na Naịjirịa."" Emechiela ụlọakwụkwọ niile Gọọmentị Legọs nyekwara iwu na ụlọakwụkwọ niile ga-emechi malite n'ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị. Otu a ka ọ dịkwa na Ogun, Kwara na mpaghara North-West niile, bụ ebe gọọmentị nyere iwu ka ụlọakwụkwọ mechie. Ndị gọọmentị ọwụwa anyanwụ amabeghị ọkwa dị otu a. Ọrịa coronavirus n'Afrịka ga-aka njọ - WHO Onyeisi otu WHO Tedros Ghebreyesus Onyeisi otu 'World Health Organisation' adọọla ndị ọchịchị Afrịka aka na ntị ka ha dị njikere maka nke ka njọ gbasara ọrịa coronavirus. Ghebreyesus kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'abalị Wenezde. O kwuru na coronavirus na-akpa ike na mba ndị ọnọdụ ahụike ha siri ike, nke pụtara na o nwere ike ịka njọ ma ọ gbasaa na mba Afrịka ụfọdụ na-enweghị ọnọdụ ahụike siri ike. Ugbua, ọrịa a abanyela na mba Afrịka niile ma gbukwaa mmadụ iri na isii na mpaghara ahụ. Ọrịa coronavirus agbadatala na mba Chaịna ebe o si malite. Na mba ụwa niile, ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus agafeela narị puku abụọ ebe mmadụ puku asatọ anwụọla. Mana ya bụ ọrịa ebalatala na Chaịna bụ ebe o siri malite. Ụlọakụ etiti ebupụtala ego maka ọrịa coronavirus Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na ha ewepụtala otu tarị naịra na ụma iji kwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa dịka ọrịa coronavirus ka na-akpa ike. Emefiele kwuru na n'ime ego a, otu tarị naịra ga-abụ iji kwado ndị na-arụpụta ihe dị icheiche bụ nke ndị mmadụ ga-na azụrụ n'ihi na ngwaahịa si mba ofesi anaghịzi abata etu o si abatabu. Otu narị ijeri naịra ka a ga-etinye na ngalaba ahụike iji nye aka igbochi ọrịa coronavirus." afirika-43701640,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43701640,Ịhe ndị Naijiria na-ekwu gbasara nkwupụta Buhari,O tebeghị aka onyeisiala Naịjrịa bụ Muhammadu Buhari kwuputechara na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ na 2019.,"Ntuliaka 2019: Ndị mmadụ ekwuola obi ha gbasara Buhari Ọtutu ndị mmadụ, ọkachasị ndị otu pati dị iche iche nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuputala uche ha gbasara ya bụ nkpebi. Ụfọdụ mmadụ na-akatọ,ebe ụfọdụ nabatara mpụta onyeisiala maka ịzọ ọchịchị ọzọ Ndị otu akpọrọ Indigenous people of Biafra na ichafụ IPOB,ekwuola na obi dị ha ụtọ maka Buhari ị puta ọzọ ịzọ ọchịchị. Ha kwuru na ọ bụrụ na Buhari merie,IPOB ga-enweta Biafra ọsịsọ. Ụkọchuku Peace: Chịneke ga-eji Buhari wetara anyị Biafra Onye ọkaiwụ nakwa onye bubu onyeisi aka Ikenga akpọrọ Goody Uwazurike kwuru na iwu obodo akpọrọ ''constittution'' kwadoro onyeisiala ịzọ ọchịchị ọzọ, mana ọ bụ ihe o metere ka a ga-eji mata ma ọ ga-meri na ya bụ ntụliaka na-abia nụ.N'uche ya ọ cheghị na o metere ọfụma. Onyeisi pati akpọrọ ''United Progressive parti'' (UPP) bụ Chekwas okorie na ya bụ mkpebi bụ ihe ama na ọ ga-eme eme mana parti ya na ndị ga-ejikọ wepụta otu pati ga-achụpụ onyeisiala na ntụliaka 2019. Gere okwu ya n'uju: Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari Onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ bụ Ike Abonyi kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bu eziokwu n'iwu obodo kwadoro Buhari ịzọ ọchịchị ọzọ, mana ajụjụ onyesisiala kwesiri ịjụ bụ arọ one ọdị na ahụike a ga-ekwe ya rụọ ọrụ ọfụma ma ọ laghachị n'ọchịchị. Gere ịhe okwuru ebe a n'uju: Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari N'aka ọzọ,odee akwụkwọ mgbasa ozi pati APC na Legọọsị bụ Joe Igbokwe nabatara ya bụ ozi ọfụma. N'ọnụ ya ''Buhari bụ nnukwu uru nye pati anyị'',ọ bụ sọ ndị ọjọ na-agaghị enwe obi ụtọ gbasara mpụtagharị onyeisiala"" Pia ihe nkịrị a ka i gere ihe ọkwuru n'uju: Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43095403,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43095403,Balarabe Musa: Nyenụ Ndigbo onyeisiala na 2019,"Balarabe Musa, onye nke kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nwere, kwuru na nke a dị mkpa n'ihi na o teele aka e ji agọnahụ ndị Igbo ọkwa onyeisisala.","Balarabe Musa bụ onye anaghị ezo ọnụ ikwu ihe gbasara ịdịnaotu Naijiria Okwu ya: ""Amaghị m ihe mere ndị Ugwu, ndị Odida-Anyanwụ na ọbụladị ndị Saụt-Saụt, jiri kpaa nkata na ọchịchị ga alọghachi n'Ugwu ugboro ugboro. Gịnị mere anyị ji agba okirikiri? Ndị Ugwu anọọla n'ọchịchị ọtụtụ oge. N'ime mmadụ iri chịrị dịka onyeisiala, e chere m na asaa si na Ugwu, otu si na Ọdịda-Anyanwu, otu si na Saụt-Saụt, ma e nweghị onye si Ọwụwa-Anyanwụ."" Gịnị mere na o nwebeghị onyeisiala si Ọwụwa-Anyanwụ? Balarabe Musa kọwara na 'ndị ọnụ na-erụ n'okwu n'Ugwu na Ọdịda-Anyanwu na-atụ egwu na Igbo ọnụ na-eru n'okwu kwenyere na ọchịchị onyekwuoucheya na ihe onye-ketere-ya-rie, karịa ndị Ugwu na ndị Ọdịda-Anyanwụ'. Ọ gara n'ihu jụọ, ""gịnị mere na a gaghị esoro usoro iwu onye-keta-ibe-ya-eketa (National Character) ma nye ndị Igbo ọchịchị ugbua? A na m ekwu 'nye,' maka na nke a abụghị okwu ntuliaka ndị mmadụ."" Ka Balarabe Musa na ndị ntaakụkọ Sun na-ekwu, ọ sị na ya ekwetaghị na ọ bụ maka na Ndigbo na-ekwu okwu ka e nye ha Biafra ka e jiri jụ inye ha ọchịchị. Ọ sị: ""Ọ bụghị maka na Ndigbo na-ekwu ka e nye ha ala nke ha. Ndigbo ka kwenye na Naịjirịa karịa ndị Ugwu maọbụ ndị Ọdịda-Anyanwụ n'ihe gbasara nkwalite ịdịnaotu nke Naịjirịa. Nke a bidoro tupu afọ 1950. E kwuwe okwu agbụrụ, Ndigbo kachasị na-akwalite ịdịnaotu nke ala anyị. Onweghị mgbe ha kwuputara okwu nwere onwe ha karịa ka alụchara Agha n'ihi ihe Agha mere. Ha ka kwenye n'otu Naịjirịa karịa ndị Yoruba na ndị Awụsa ndị bụ ndị chọrọrị nkewa.""" afirika-48634019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48634019,Ukraine and U20 world cup: South Korea eburula ihe na-esi n'iko mbaụwa U20,Ndị egwu bọọlụ mba Ukraine ewerela ọkpụ goolụ atọ asatara otu merie Saụt Korea were maburu iko mbaụwa ndị erubeghị afọ iri abụọ agbara na mba Poland taa bụ Satọde.,Mmeri a bịara ka ndị Saụt Korea nwetechara penariti n'ụzọ ụtụtụ ya bụ egwuregwu na nkeji ise bụ nke Lee Kang-in tinyere ha na goolu. Flying Eagles ejirila ikiriki eze gafee Otu Naịjirịa alaferela n'asọmpi AFCON U20 Mana Ukraine gwara Saụt Korea na ha apụtaghị egwu ọnwa mgbe Vladyslav Supriaga sara ya bụ goolu na nkeji iri atọ na anọ. Vladyslav Supriaga kwuru n'ezie na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa na nkeji iri ise na atọ bụ mgbe o tinyere goolu nke abụọ ya n'ọnụ mpiọ ndị Saụt Korea. Ndị Korea kpọkwara ganịganị ọtụtụ mgbe mana Ukraine gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola mgbe ha mezuru ya ọkpụ atọ site n'aka Giorgi Tsitaishvili na nkeji iri asatọ na itoolu. Uwa a gbaa Saút Korea gharí Ụwa gbara Saụt Korea gharị mgbe opi ike daara na ngwụcha ya bụ egwuruegwu. Nke a bụ mbụ Ukraine na-emetu ya bụ iko mbaụwa aka ka England buchere ya afọ abụọ gara aga. Akụkọ ga-amasị gị 'Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON' - Mikel Obi Uloikpe mkpegharị eweliela Chimaroke aka elu ọzọ Ọzọdịmgba eloro nde naira asaa n'ogige ụmụanụmanụ nke Kano? Lee ihe nkiri anyị Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise ọmere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee afirika-48556564,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48556564,Imo Awka: Mmemme a bụ Opu-Eke,Ka mgbe otu Udi uka mmemme dị iche iche juputara n'Awka iji kelee o Awka maka nchekwa ochekwabara ha ya na ịza ha ekpere mgbe niile.,"Ndị agbara Ezenwaanyị na-efe Imo Awka, na agbara ya egwu mmụọ bụ Opu-Eke iji kelee ya maka onyinye onyere ha Mmemme ""Opu Eke, Imo Awka"" bụ ụbọchị ụmụnwaanyị na-efe Imo Awka ji enye ya onyinye maka nchekwa ya n'afọ gara aga. Ha na ekwe ya nkwa, yọkwaa ya arịrịọ ngozi maka afọ ọhụrụ nke ha na-abanye. Lee etu o si gaa ka BBC Igbo tụrụ ụkwụ ebe ahụ n'ụbọchị nke mbụ: Content is not available End of Facebook post, 1 Content is not available End of Facebook post, 2 E mere emume a ụbọchị abụọ tupu ọ bịa n'isi njedebe. N'ụbọchị nke abụọ, ndị nmmadụ pụtara n'igwe iji bịa nwere obi aṅụrị dịka emume a na-aga. Ezenwaanyị na-efe Arụsị Imo Awka. Na ya bụ obi arụsị ahụ nke a na-akpọ ""Ọrụrụ Imo Awka"" ndị Ezenwaanyị dị icheiche kpụtara ya bụ arụsị ehi, ebune, ji nakwa onyinye ndị ọzọ. Ndị pụtara ịkiri mmemme Imo Awka Nke a bụ iji gosi obi ụtọ ha na ebe arụsị Imo Awka nọ nke ha na-akpọ nne ha. Nwaekemezie Onwudinjo, Aka na-akụ Opu-Eke na mmemme Imo Awka. Naanị out nwoke na-akụ ya bụ opu Eke, ọbụkwazị naanị onye Eze nwaanyị tozuru etozu, nọrọ na mmụọ ka ya na arụsị Imo Awka ga-agbakọ Opu Eke ya. Akụkọ ga-amasị gị" 45167110,https://www.bbc.com/igbo/45167110,Enyi mmiri atagbuola onye mere njem gaa Kenya,Onye mba Tayiland gara njem nkiri na Kenya anwụọla ka enyi mmiri tasra ya ebe ọ na-achọ ise foto.,Chan Ming Chuang dị afọ 66 nọ na-eso ya bụ anụmanụ n'ebe nkiri dị n'akụkụ mmiri Naivasha na nso isi obodo Kenya bụ Nairobi. Onye ọzọ na-emekwa nkiri bụkwa onye mba Tayiland merụkwara ahụ ebe ahụ. Mmadụ isii anwụọla n'aka hippo n'akụkụ ebe ahụ n'afọ a. Ebili mmiri na-ebupụta anụmanụ ahụ buru ibu nke ukwuu n'ala ebe nkiri ahụ ebe ha na-achọ nri. Ndị ọrụ nchekwa anụmanụ ọhịa na mba Kenya kpọburu ndị ahụ ndị China mana ndị isi mba Tayiland pụtara kwuo na ha bụ ndị obodo ha. Kenya na Tayiland enweghi njikọ ọbụla mana ha na-anabata mkpesa ha na-eme gbasara ala ahụ mmiri gbara gburugburu. Ndị hụrụ oge ihe a mere kwuru na mmadụ abụọ gakwuru anụmanụ ndụ nso karịa. E bugara onye nke ọ tara n'ụlọọgwụ ozugbo ebe ọ na-agba ọbara nke ukwuu mana o mesiri nwụọ. Enyi mmiri na-awakpo mmadụ rie nne ma nwee eze dị nkọ ma bukwa ibu nke ukwuu we na-egbu ihe ruru mmadụ 500 na mpaghara Afịrịka kwa afọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: egwuregwu-46661584,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46661584,EPL Results: Manchester United ezuola Cardiff City ike n'ahụ,"Ọ bụ eziokwu na a na-agba bọolụ, e kwesịrị ibu n'obi na ụfọdụ oge ọ ga-abụ ""ndị n'ọchị, ndị n'akwa"", mana etu nke izu a si gaa enyeghị ọtụtụ ọnụ okwu.","Ihe a gbatara na Premier League n'ụbọchị Disemba 22, 2018, mere ndị Chelsea na Manchester City ""vum n'anya"". Manchester United zuru Cardiff City ike n'ahụ: Man Utd nyere goolu ise iji merie Cardiff City na be ndị Cardiff n'agbanyeghị na Victor Camarasa gbakpuru otu goolu ha si na penariti nweta. Goolu Marcus Rashford nyere na nkeji atọ e ji bido bọọlụ, nke Ander Herrera nke Anthony Martial nyere na nkeji 41 na nke Jesse Lingard ji penariti gbakpuo na nkeji 57 nakwa nkeji 90, nyere Man Utd onyinye na-agụ ha n'ekeresimesi a. Nke a bụ mmeri mbụ ha na-emeri ka Ole Gunnar Solskjaer bidoro ịchịkọta ha dịka onye ga-elekọta otu ha ruo oge a Man Utd ga-ahọpụta onye ga-anọchite Jose Mourinho ha chụrụ achụ. @MxZVGx_ kwuru na Man Utd achakeela ka ọnwa. Ọ bụkwa mbụ ha na-enye goolu ise n'ime otu egwuregwu Premier League kemgbe Alex Ferguson rituru n'oche nchịkọta ha na 2013. @ebuka_akara kwuru sị na Man Utd kwesịrị ịga gbubiri oke ha n'ego a kwụrụ Mourinho oge ọ na-apụ. Ajụjụ bụzị ""Mourinho ọ bụbu agada gbachiri ụzọ nye ha?"" Chelsea zutere Leicester City: Ebe Wilfred Ndidi na Kelechi Iheanachọ bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Leicester City bọọlụ ga-arahụ ụra ọfụma n'abalị a, nwanne ha nwoke bụ Victor Moses ga-anọ n'echiche maọbụ buru ọnụ laba. Ị na-ajụ ihe kpatara nke a? Ọ bụ makana Leicester City ji otu ọkpụ goolu merie Chelsea na Stamford Bridge bụ be ha. Chelsea na onwe ha riri ihe ruru goolu anọ, mana goolu Jamie Vardy nyere na nkeji 51, mere ka ndị na-akwado Leicester City hụ ihe ha ga-eji enwe aṅụrị. @EnekemGreg kwuru na o cheghị na a ga-emeri Chelsea n'egwuregwu a: @SirVee kwuru na oge eruola mgbe Sarri bụ onye nchịkọta Chelsea ga-agbanwe ndị ọ na-eji ebido bọọlụ. Manchester City na Crystal Palace: Mmeri e meriri Man City juru ndị mmadụ anya, makana ọ dịzị ka ha esi n'elu tebulu kụọ afọ n'ala. Crystal Palace nọ n'ọkwa 14 ji goolu atọ a satara abụọ merie Man City n'ogige egwuregwu Etihad bụ be ha. N'agbanyeghị na Ilkay Gundogan bu ụzọ nye goolu na nkeji 27, ụkwụ esighi Man City ike, ruo mgbe Kevin de Bruyne nyere ọzọ na nkeji 85. Mana nke ahụ azọghị ha n'aka ndị Crystal Palace. Goolu Jeffrey Schlupp nyere na nkeji 33, nke Andros Townsend nyere na nkeji 35 na nke Luka Milivojevic ji penariti nye na nkeji 51, nyere Crystal Palace mmeri na-agụ ha kemgbe. @subashpoudel918 kwuru na Liverpool nwekwara ibuli iko Premier League nke afọ a maka mmeri Crystal Palace meriri Man City. Arsenal na Burnley: Obi na-atọ ndị na-akwado Arsenal pọlịna pọlịna ka ha gbara Burnley ọkpụ atọ asatara otu n'ogige egwuregwu Emirates bụ be ha. Mmeri a ga-eme ka ha chefuo etu onye ọbụla si kpụrụ ha n'ọnụ ka Southampton na Liverpool nyeruchara ha goolu atọ atọ oge ha zutere n'izu gara aga. Alexander Iwobi bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Arsenal ga-arahụ ụra ka nwa a mụrụ ọhụrụ, ọkachasị nke a o so na ndị mere ihe ha ji nweta mmeri. Pierre-Emerick Aubameyang bu uzọ nye goolu na nkeji 14 na 48, Ashley Barnes nke Burnley sara ya na nkeji 63, mana goolu Iwobi nyere na nkeji 90 na ụma, mere ka Burnley bụrụ ndị a gbawara obi taa. Aubameyang kwuru na goolu ya bụ onyinye o ji agbara ndị Arsenal ekeresimesi. Akụkọ ga-amasị gị:" 45021683,https://www.bbc.com/igbo/45021683,Nwata nwaanyị eburula ego ọga ya gbaa ọsọ,Ụlọọrụ na-ebuso nrụrụaka agha ngalaba nke Enugwu steeti akpụpụla otu nwaanyị ụlọikpe make ebubo izu nde naira 3.3.,"Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị ahụ kugburu nne di ya A na-ebo Florence Okorie bụ onye na-anakọ ego n'ụlọ oriri a kpọrọ Nice and Cool dị n' Enugwu. Okorie, onye Obeagu Amechi dị n'Awkunanaw n'Enugwu rụrụ Nnaemeka Nnamani onye nwe ụlọ oriri ahụ ọrụ afọ asatọ ma na-ezupu ego nwoke ahụ n'ụlọakụ dịka nke ya. Mgbaama gbara Nnamani nke mere ka ọ nwụchie Okorie ebe ọ na-akwụnye narị naịra atọ ego e chere na ọ bụ nke ụlọọrụ n'aha ya onwe ya n'ụlọakụ nke mere ka Nnamani kpee ya n'aka EFCC. Nchọpụta EFCC mere gosiri na Okorie onye na-eri puku naịra asaa dịka ụgwọ ọnwa oge o bidoro ọrụ n'ụlọọrụ ahụ ewepụla ihe karịrị nde naịra itoolu(N9.7m) nke a na-eche na o jiri zụọ ala, keke, ọdọahịa nakwa ụlọ nwere ọnụmara asaa. Oge a gụpụtara ebubo megidere ya n'ihu ọkaikpe H.O Eya nke ụloọikpe ukwu dị n'Enugwu, maka izu ihe karịrị nde naịra atọ, ọ gọrọ na ya emeghị ihe dị otu a. Akụkọ ga amasị gị:" afirika-49275692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49275692,Catholic Priests Protest: 'Jogging' ka ndị ụkọchukwu mere n'Enugu - Mbaka,Fada Ejike Mbaka agọrọla ụkwụ na aka na o soghị mee ngagharịiwe ndị fada ụka Katọlik mere n'Enugwu n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019.,"Ndị na-ede akụkọ ụgha gbasara m ga-edeta abụmọnụ - Mbaka N'okwu o kwuru ka ọ na-ezisa oziọma n'ụlọụka ya, o kwuru sị na ndị fada mere ngagharịiwe maka ọnwụ Paul Offu, kpara agwa ụmụaka. Mbaka bụ ụkọchukwu a ma ama na-elekọta Adoration Ministries Enugwu kwuru sị na ndị fada ibe ya emeghi ihe kwesịrị ekwesị. Ọ kọwara na ọ gwara ndị fada ibe ya ka ha chere ka gọvanọ nnyochaa ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghụrụ, mana ha egeghị ya ntị mapụ n'ezi malite ime ngagharịiwe. O kwuru sị na akụkọ na-foto na-efegharị na o so ndị fada ibe ya mee ya bụ ngagharịiwe, bụ okpotokpo asị n'ihi na ọ nọ n'Abuja mgbe e mere ihe ahụ. Ndị fada mere ngagharịiwe maka ogbugbu fada Offu O kwuru na ọ bụ Fada Valentine Ubaene yiri ya nọ na foto ahụ, na ọ bụghị ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-ede akụkọ ụgha a na-edetere onwe ha abụmọnụ makana ha na-edegide ""onye e tere mmanụ nsọ"". O kwuru na ekpere ya bụ na a ga-achọpụta ndị gburu fada ahụ ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịkpọzị ndị Fulani ọchịehi aha, ganye na gọọmentị achọpụtala n'ezie na ọbụ ha gbagburu Fada Paul Offu. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe Cheta na ndị ụkọchukwu karịrị otu puku gagharịrị Enugwu niile ma gakwaa n'obi gọọmentị iji gosi iwe dị ha n'obi maka ogbugbu ndị omekome gburu Paul Offu nakwa Fada Clement Ugwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45140562,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45140562,Davido: Gịnị jịkọrọ Davido na Ndigbo?,"Aha David Adeleke ,otiegwu ama dịka Davido na-ewu ewu tata bụ Tọọsde sde na soshal midia maka na ọ gara n'ogige ndị ji otu afọ efe ala Naijiria na Legọs dịka otu onye n'ime ha.","End of Twitter post, 1 Dịka o siri depụta n'igwe okwu Twitter ya, ndị ogbo ya na ndị ọrụ NYSC wakporo ya. End of Twitter post, 2 Njem a ọ gara ibido ofufe ala nna mere Davido okwu akpụ n'ọnụ ogige ahụ nakwa na soshal midia. Cheta na nsonso, Davido kpanyere ọkụ na soshal midia oge egwu ọhụrụ ya bụ 'nwa-baby' pụtara... Davido emepụtalarị 'Assurance' o tiri maka enyi ya nwaanyị bụ Chioma nakwa ọzọ wuru ewu bụ 'Flora my flawa'. Mana ị ma ụzọ Davido jiri yie ndị Igbo? Kemgbe mbido 2018, ihe kacha ewu na ndụ Davido karịchaa egwu ndị o tiri na nturuugo BET o ritere na mba Amerịka, bụ enyi ya nwaanyị bụ Chioma Avril Rowland. Nkwupụta Davido na ọ na-ayị Chioma so mee ka ọtụtụ ndị Igbo bido ị hụ ya n'anya karịchaa etu ọ dị na mbụ. Ka Davido bidoro ịyị Chioma, e setere ya n'ihe nkiri ebe o kwuru sị na ""ndị Igbo na-enwe mmeri"". Davido tiri egwu aha ya bụ 'NWA BABY'. David Adeleke N'agbanyeghị na ọ bụ onye Yoruba, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka na ọ na-ayị onye Igbo mere o ji họrọ aha Igbo. @iamflamie1 na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo na-anwakwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43137884,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43137884,Messi nyere Barcelona nhatanha ụnyaahụ,"Ọkpụ goolu mbụ Lionel Messi nyere n'asọmpi Champions League itoolu ọ gbasoro Chelsea, nyerela Barcelona aka iwetara ha nhatanha na Stamford Bridge.","Nke a bụ gọọlụ mbụ nke Messi n'asọmpị isii Chelsea gbochiri Messi ebe Willian nke Chealsea bịara nsọ inye gọọlụ ugboro abụọ na ọkara nke mbụ tupu ọ gba ọkpụ nyere ndị otu Conte ohere ị buru ụzọ n'elekere iri isii n'abụọ. Otu Barcelona sị n'aka Iniesta nye ọkpụ abaghị tupu Messi ejiri ụkwụ ekpe ya nye ọkpụ goolu ahụ na nkeji ịrị asaa n'ise nyere ha na otu Chelsea nhatanha. N'asọmpị Champions League ndị ọzọ, ndị amama Germany bụ Munich meriri Beskitas otu ndị Turkey ọkpụ ise asataghị ihe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46428649,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46428649,The Experience 13: Ndị egwu Igbo anọ so eme ka o nwuru ọkụ,"N'ime ihe karịrị ndị otiegwu 10 ga-eti egwu n'emume ""The Experience 13"" nke afọ 2018, Ndigbo anọ so na ndị a ga-anụ olu ha ebe ahụ.","The Experience 13: Lee ka Don Moen na otiegwu ndị ọzọ na-asụ Igbo Dịka ọ na-akpọtụ, ụfọdụ n'ime ha bụ ndị bịarala emume a ugboro ugboro, ebe ndị ọzọ bụ ndị ọ bụ mbụ ụkwụ ha na-atụ ebe a na-eme emume a na-ekwu bụ ""emume egwu ụka Kraịst kachasị akpọtụ na mbaụwa"". Ndị Igbo nọ ebe ahụ: Chioma Jesus A ma ya dịka ""Chioma Jesus"", mana ezigbo aha ya bụ Amaka Okwuoha. Ọ malitere ịgụ egwu n'ụlọụka oge ọ ka bụ nwatakịrị dị afọ itoolu. O nwetala ọtụtụ ihe nrite site n'ịgụ egwu ụka. A bịa n'ịgụ egwu, o sorola ndị otiegwu na-ewuewu na mbaụwa dịka Ron Kenoly, Don Moen, Kurt Karr, Juanita Bynum na Lionel Peterson gụọ egwu. Chioma Jesus esorola gụọ egwu n'emume 'Experience' ugboro anọ. Tim Godfrey Timothy Chukwudi Godfrey bụ otiegwu ụka na-ewuewu ugbua, ọkachasị maka egwu ọhụrụ ya bụ ""Nara Ekele"" ya na onye mba Amerịka bụ Travis Greene, gụrụ. Ọ bụ onye Ndiowu dị n'Oko, n'Anambara steeti. Ọ bụkwa onyeisi otu egwu a kpọrọ ""Tim Godfrey and Xtreme Crew"". Godfrey esorola mee emume a ugboro atọ. Ada Ehi Ada Ehi bụ otiegwu na-ede ede ma na-agụkwa agụ. Egwu e ji mara ya bụ ""Only You Jesus"", ""I testify Jesus You are able"" na ""Bob me"". Ọ malitere ịgụ egwu n'afọ iri. Nke a bụ mbụ ọ na-abịa emume a. Chee Chee ga-agụ abụ ala Naịjirịa nke Bekee kpọrọ, ""National Anthem"". Ọ ga-agụ ya bụ abụ na mbido emume a, tupu ndị na-agụ egwu ụka amalite ịgụ egwu nke ha. Kedụ ndị ọzọ ị chọrọ ịhụ n'emume a n'afọ ndị na-abịa n'ihu?" afirika-43242225,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43242225,Zimbabwe: Ndị zuru ego enweghachila ya,Onyeisi ala Zimbabawe bụ Emmerson Mnangagwa kwuru na eweghachila ogogo ego niile ezuru ezu nke edepụtara n'akwụkwọ.,"Mnangagwa bidoro chiwa mgbe Robert Mugabe tinyere akwụkwọ arụkwaghịm Na ọnwa November gara aga, ụlọ na-ahu maka nchekwa na Zimbabwe nyere ha ọnwa ato iji weghachi ego ndị ahụ ezuru. Iwu ọnwa atọ ahụ ji ụnyaahụ wee gafee. Ndị ụlọọrụ mgbasa ozi a kpọrọ Bulawayo 24 depụtara ihe Mnangagwa kwuru dịka onye obi ụtọ na-akpa maka ihe a merenụ: ""Ụfọdụ ndị hụrụ obodo ha n'anya e weghachila ego ha zuru. Aha ndị zuru ego edepụtara karịrị, mana a ga-akpọpụta mkpebi erutere"". Akụkọndị ọzọ ga-amasị gị: N'ime akwụkwọ ahụ onyeisi ala Zimbabwe kwuru na ya chugide ndị niile na-eweghachibeghị ego ha zuru rue mgbe ha wetere ya. ""Anyi ji aha ụnụ ma jidekwa ihe niile ụlọakụ nyere anyi gbasara ụnụ."" A na-atụ anya na ụdị ihe a ga-eme na Naijiria ebe akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị nọ ọchịchị zuru ọtụtụ ego." afirika-49233272,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49233272,Omoyele Sowore: Ndị na-eme ngagharịiwe 'Revolution Now' na-achọ ịzọ ndị otu ha a nwụchiri,"Ndị otu ngagharịiwe 'Revolution Now' apụtaghị ime ngagharịiwe ha n'ụbọchị Tuzde 6, Ọgọst 2019 dịka ndị uweojii na ndịagha jupụtara n'ebe ha sị na ha ga-ezukọ na Legọs.","Otu onye n'ime ndị otu 'Revolution Now' bụ Usman Oloyede gwara BBC na ""ngagharịiwe ka na-aga n'ihu agbanyeghi na ha anọghị n'ihu ọrụ"", mana ọ dị ndị Naịjirịa n'obi. Oloyede kwuru na ha na-aga na Panti bụ ụlọ ndị uweojii dị na Yaba, Legọs ebe ha nụrụ na-akpọchiri ndị otu ha. ""Dịka m na-agwa gị ugbua, anyị na-aga ebe ahụ ile ma a ga-atọhapụ ndị anwuchiri ụnyaahụ mana nke a agaghị akwụsị anyị"". Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ ""Revolution Now"" Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ ""Revolution Now"" n'ọgbọegwuregwu ""National Stadium"" dị na Legọs. Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbakọrọ iso mee ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche, ndị nke gbakọtara na Legọs nọ na mbombo ọsọ dịka ndị uweojii na-achụ ha. Lee foto ndị si ebe ndị mmadụ gbakọrọ na Legọs: Onye uweojii ji mmiri ose na-agba ndị mmadụ Ndị uweojii malitere ịnwụchi ndị mmadụ nakwa inyocha ekwentị ndị mmadụ Onye uweojii yi komkom anwụrụ ose Ka ọ na-ewete aka ebe elekere itoolu nke ụtụtụ, ndị uweojii malitere inwe aṅụrị na-agụ egwu na ha achụsasịala ndị mmadụ. Ndị uweojii na-agụ egwu Ndị uweojii chụsasịrị ndị mmadụ na Legọs Ndị ntaakụkọ BBC gara ebe a na-eme ya bụ ngagharịiwe nọ ebe ahụ sete ihe nkiri na-egosi ka ihe na-eme si eme. Lee etu ndị mmadụ si na-eme ""anyị agaghị ekwe"" na Legọs: Iwe ji nwoke na-abara onye uweojii mba N'Abuja, Ụgbọala ndị uweojii nọchiri Unity Fountain bụ ebe e kwuburu na a ga-agbakọ mee ngagharịiwe n'Abuja Ndị uweojii na-anyagharị ụgbọala ha na Unity Fountain Na Pọtakọt, Ndị mmadụ apụtaghị ime ngagharịiwe, mana ndị uweojii kwụchiri n'ihu Isaac Boro Park bụ ebe e kwuburu na a ga-agbakọta wee mee ya. Ndị uweojii na-eche Isaac Boro Park nche Solomon Lenu bụ onyeisi otu a kpọrọ ""Excellent Achievers Movement"" nakwa ọnụ na-ekwuchitere otu ""Renaissance for Peace and Empowerment Initiative"" na-akwado ngagharịiwe a na Pọtakọt, gwara onye ntaakụkọ BBC na ha agaghị emezi ngagharịiwe makana gọọmentị ewerela ndị ọrụ nchekwa nọchie ebe niile. O kwuru sị na ha achọghị itinye ndụ ndị mmadụ bụ ndị e ji maka ha ekwu okwu ya bụ ngagharịiwe na nsogbu. Ndị uweojii na-eche nche ịhụ na ndị mmadụ agbakọghị mee ngagharịiwe n'ihu Isaac Boro Park Cheta na aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike, nyere iwu sị na ọ chọghị iji ntị anụ na e mere ụdịrị ihe a na steeti ya. Na Kano, Ndị mmadụ apụtaghị isonye na ngagharịiwe e yiburu na a ga-eme na Kano. Ebe e yinyeburu na a ga-esi malite ime ngagharịiwe ""Revolution Now"" Ebe e yinyeburu na a ga-esi malite ime ngagharịiwe ""Revolution Now""" afirika-50217737,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50217737,Enugu Kidnapping: A tọhapụla Fada Arinze Madu a tọrọ n'Enugwu,"A tọhapụla Fada Arinze Madu nke ụlọakwụkwọ Queen of Apostles Seminary School, Imezi-Owa n'Okpuru Ọchịchị, Enugwu steeti.","Ndị ntọ tọrọ Fada Arinze Madu na mgbede ụbọchị Mọnde 28 Ọktoba, 2019 n'ọnụzọ ama ụlọakwụkwọ ahụ dịka ọ kwọ ụgbọala ya apụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ ,Ebere Amaraizu kwuru na ọ bụ ezie na ahapụla Fada Madu mana o kwughị ma a kwụụ ụgwọ iji gbapụta isi ya. BBC Igbo gbara mbọ inweta echiche ndị ụka Katọlik n'Enugwu mana e nwetabeghị ha ugbua anyị na-ewetara gị akụkọ a. Fada Madu so n'ime ndị ụkọchukwu na-elekọta ụlọakwụkwọ semịnarị a anya. Fada bụ onye e chiri ụkọchukwu n'afọ 2017 bụbu ụkọchukwu nke St. Michaels Katọlik dị n'Ugwuaji tupu ọ gaa n'ụlọakwụkwọ seminari a bụ ebe a tọrọ ya. Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu gwaburu BBC na ndị uweojii na-agba mbọ ịchọpụta ma tọhapụ Fada a. Amarizu kwuru na ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Madu ma ọ bụ sị ha kwụọ ụgwọ ego ọbụla n'isi ya iji gbapụta. Ọnụ na-ekwuru ndị ụka Katọlik n'Enugwu bụ Fada Benjamin Achi tuburu arrịrị sị na ọ bụ ihe mwute ma kwuo na ụka Katọlik Enugwu nke Bishop Onaga nọ n'isi ya adịbeghị njikere ikwu ihe ọbụla banyere ya. Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48262039,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48262039,"Ebonyi state: Ihe mere steeti a ji bụrụ ""elelịa nwa ite""",Ị ma na Ebonyi steeti nwere ọtụtụ ihe ndị ga-eme gị kwata ma biri ebe ahụ?,"Ndị egwu ụmụada nakwa ndị nne egwu ha Kedụ ihe ọjọọ ndị ị nụrụla maka steeti a e kere n'afọ 1996? Ị nụrụ na ha ""na-ewe iwe ọkụ""? Ka ị nụrụ na ""ịgba bọy na-amasị ha"" ""ha enweghi mmiri""? Ụfọdụ nwere ike ikwenye n'akụkọ ndị a, mana eziokwu bụ na Ebonyi nwere ihe ọma ga-eme ka ị gaa na steeti ahụ ugboro ugboro. Ihe ndị a ga-eme ka Ebonyi steeti bụ ""ọdụ nwa n'ala Igbo"" gụọ gị agụụ: 1) Ha bụ ""nkata nri"" Ala Igbo: Ị chọọ ịgaru Ebonyi steeti, mara na ị ga-akwado akwado, mepee afọ gị maka iji nri afọju ya. Ọrụ ugbo doro ha anya, mere ka nri bụrụ ""gbanyụ"" ma ghara ịbụ nsogbu nye ha. A bịa na osikapa, ha bụ ""eze"". Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru Ị chọkwaa nnu ị ga-eji eme ka nri gị tọọ ụtọ, Ebonyi ga-enyekwa gị nke a. Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Ị hụla ji ha na-akọ? Ụfọdụ na-aha ka aka ""ndị nne maama"". Echefukwala ịjụ ese ofe egburegbu ndị Edda ma ị garuo. 2) Ha bụ ndị obiọma na ndị obi umeala: Ndị Ebonyi ma etu e si anabata mmadụ n'agbanyeghi ebe i si. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị obiọma, ilekọta mma anaghị eche ha uche. Ị che na ọ bụ asị? Ngwanu kedụ etu ị ga-esi kọwaa ihe mere Ugochukwu a ma ka ""gala boy"" si were ihe ọ na-ere nye ndị nga ọ hụrụ n'ụzọ? Gala boy: E kerem ndị mkpọrọ gala m na-ere maka na anọtụalam ọnọdụ ahụ 3) Ụzọ dị na steeti ha bụ saraa: Elezighi anya, okporoụzọ dị n'Ebonyi steeti, ọkachasị isiobodo ha bụ Abakaliki, nwere ike ịbụ nke kacha mma na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa. Ọtụtụ ndị Ebonyi na-ekwuzi na ọ dị ka ""small London"". Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu 4) Omenala ha na-atọwa ntị: Emume dị ka ịgba mmọnwụ na omenala ndị ọzọ na-agara ha aka ọfụma. Afikpo Festival: Egwu nkwa nwaite ka eji mara ha Ị nụla maka Olo nakwa Oke Nkwa? Kedụ maka Nkwa Ụmụagbọghọ? Jụọ onye si Ebonyi steeti. Ọ ga-akọwara gị. Egwu Oke Nkwa Ọ gụọla gị agụụ ugbua? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-49043502,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49043502,Senegal vs Algeria: Onye ga-amaburu Iko Afcon taa?,Mba Senegal na Algeria ga-ezute taa n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Kaịro di n'Ijipt n'asọmpi agbachaa ekuru nwa nke Africa Cup of Nations.,"Sadio Mane na Mahrez ka anya abụọ ga-eso taata Mgbe Algeria rutere agba ikpeazu asọmpị a bụ afọ iri abụọ n'itoolu gara aga. Amụbeghị ọtụtụ ndị sọ asọ mpị a mgbe ahụ. Mgbe ahụ bụ afọ 1990 mgbe ha na Naịjirịa zutere na be ha. Ha ji otu ọkpụ asataghị asata wee sị Naịjirịa ha were ọla ọcha kasie onwe ha obi. Onye nkuzi Senegal bụ Aliou Cisse na nke Aljeria bụ Djamel Belmadi O ruola afọ 17 kemgbe Senegal tụrụ ụkwụ na agba ikpeazụ Afcon. Nke a bụ n'afọ 2002. Onye nkuzi ha ugbua bụ Aliou Cisse so na ndị sọrọ mpị mgbe ahụ Kameroon ji ọkpụ atọ asatara abụọ merịe ha n'agba penarịtị. Nke a bụ nzute nke abụọ Ọlgeria na Senegal na-ezute onwe ha n'asọmpị Iko Mba Afịrịka nke afọ a. Aljeria ji otu ọkpụ asataghị asata merie Senegal na nzute ahụ. Etu mba abụọ a kwụ n'asọmpị a Senegal: Sengal agbaala asọmpị isii. N'ime ya ha meriri anọ, gbaa nhatanha otu ma gbara aka n'otu. Ha nyekwara gọọlụ asatọ Onye egwu ha ama ama bụ Sadio Mane Algeria: Algeria agbaala asọmpi isii. Merie ise n'ime ha ma gbaa nhatanha n'otu. Ha enyeela goolu 12 Onye egwu ha ukwu na-atụ nkọ bụ Riyad Mahrez." 43071951,https://www.bbc.com/igbo/43071951,Don Waney: Ndị uweojii agbagbuola onye ntọ na Delta,Ndị uweojii na Delta steeti egbuola otu onye a na-ebo ebubo na ọ bụ onye ntọ aha ya bụ Augustine Agulegbu.,"Ndị uweojii na-achọ ọtụtụ ndị ntọ ndị ọzọ Ha kwuru na Augustine Agulegbu bụ otu n'ime ndị otu Don Waney bụkwa onye ndị uweojii gbaburu n'ọnwa Janụwarị n'afọ nke a. Ndị nche obodo pụrụiche bụ Department of State Services n'olu bekee kwuru na ha wakporo Agulegbu na New Sapela Road n'ime Delta steeti ebe a gbagburu ya. DSS kwukwara na onye ọzọ ha na achọ ugbua bụ otu nwoke akpọrọ Emenike. Emenike bụ otu n'ime ndị Gọvanọ Rochas Okorocha mmere mgbaghara. Evans bụ onye ntọ mmadụ tọrọ ọtụtụ mmadụ Nke a ọ ga-ebute udo? Otu nwoke bi na Delta steeti aha ya bụ Ted Ugbovo gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ogbugbu ha gburu Augustine Agulegbunjọ enweghị ihe ọpụtara. Ted kwuru: ""Ndị uweojii na-egbu ndị ntọ mmadụ oge niile, mana ndị otu ha na-emechekwa mmalite ọrụ ha. Nke a bụ maka ọrụ adighị n'ala anyị."" O kwukwara na ""Cheta na e ji Evans na Lagos, mana ọ kwụsịrị ntọ mmadụ? ihe ndị uwe ojii kwesịrị ime bụ ị kwalite nchekwube ndị mmadụ nwere n'ala Naijịrịa. Ọ bụghị ị me mkpọtụ na ha gburu otu onye ntọ"" Evans na ndị ntọ ndị ọzọ Ugbu a, Evans na-aza ọnụ ya n'ụlọ ikpe n'Lagos. O nwere ike ị ga nga ebebe maọbụ na ikpe maa ya. DSS na-ekwe nkwa na ndị ntọ niile nọ n'ala Naijịria anaghị enwe ezumike." afirika-46667792,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667792,2023 Presidency: Naijirịa ga-anọ n'ọchịchịrị maọbụrụ na onye Igbo achịghị - Ohaneze,Ọtụtụ mmadụ ka na-ekwu maka akụkọ pụtara n'elu soshal midia na Yemi Osinbajo kwuru na oche onyeisiala ga-agara ndị Yoruba n'afọ 2023.,"Ndị na-akatọ etu esi were oche onyeisiala 2023 eme ndọrọndọrọ ọchịchị Ọ nụ na-ekwuchitere otu Ohaneze ndị Igbo bụ Uche Okpaga kwuru na Naijirịa ga anọ n'isi maọbụrụ na onye Igbo achịghị. Ọ gụpụtara ndị dịka Chukwuma Soludo(Onye bụbụ gọvanọ CBN) ,Onyebuchi Chukwu(Onye bụbụ minista na-ahụ maka ahụike) ,Dr Ngozi Okonjo-Iweala(onye bụbụ minista na-ahụ maka nhazi akụ na ụba Naịjirịa, Dora Akunyili(Onye nwurulanụ) nakwa ihe ha mere Naijirịa mgbe ha nwere ife ala nna ha. O kwuru na ọ ga-agụta ole ghara ole. Okpaga kwuru na ndị Igbo ga-achị mgbe Chukwu chọrọ ka ọ bụrụ agbanyeghị ihe mmadụ na-elo. Ihe PDP kwuru Onyeisioche PDP bụ Uche Secondus kwuru na ndị APC na-eme ihe ọ bụla iji wee nweta ihu ụmụ Naijirịa . O kwuru na okwu a dịka nwaanyị na-aghọrị ụmụ nwoke karịrị otụ na ọ ga-alụ ha niile. Secondus kwuru na ọgbagọjuru ya anya etu onye dịka Yemi Osinbajo ga-esi na-atụ asị makana onweghị pati APC ga-esi nye mpaghara abụọ oche onyeisiala n'afọ 2018. N'ọnụ ya, ""minista na-ahụ maka ọkụ latrịk na ụlọ obibi bụ Babatunde Fashola kwuru na apc ga-enye onye Yoruba akwụkwọ ikike izọ oche onyeisiala mana odee akwụkwọ gọọmenti etiti kwuru na ọ bụ asị .Kedụzi ihe ha ji atụrụ asị maka ndọrọndọrọ ọchịchị?"" Afenifere site n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha ọnụ bụ Yinka Odumakin, mgbe ọ na-asa onye natakụkọ ajụjụ jụrụ ihe ndị Yoruba ritegoro n'aka Osinbajo kamgbe ọ nọ n'ọchịchị. Odumakin kwuru na osote onyeisiala apinyụọla ihe niile jịkọtara ndị Yoruba kamgbe ọ banyere ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 51844858,https://www.bbc.com/igbo/51844858,World Kidney Day: Lee ụzọ ị ga-esi chutee ọrịa akịrị (kidney) na ndụ gị,BBC Igbo jụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ahụike bụ Patience Chimah gbasara nri ga-enye mmadụ ahuike.,"Ọ kọwaara anyị ọtụtụ ihe e kwesịrị iri bụ nke ga-inye akịrị (kidney) gị ahụike. Nri ogbenye ọgalanya na-erizi Na mbido, Chimah kọwara na akịrị bụ akụkụ ahụ mmadụ na-ewepụ atịtị maọbụ ụyi dị na mmiri n'ime ahụ mmadụ. Ọ sị na akịrị bụkwa ihe na-enye aka n'ịhụ na mmiri, nnu na mịneralụ na-edozi ahụ dị nhatanha n'ahụ. Mịneralụ ndị dịka; sodiọm, kalshịọm, fosforọs na potashịọm dị n'ọbara. Chimah bidoro nkọwa ya sị, ""nri ụfọdu na-adịrị ndị nwere ọrịa kidney mma nwereike agaghị adịrị ndị ọzọ mma nihi ụdị erimodo ha nweburu n'ahụ ha."" Chimah kwuru na, ""tupu anyị aga n'ihe gbasra nri dịrị akịrị mma, ka m kwusie ya ike na nri kachasị akịrị mma na nri niile n'ụwa bụ mmiri."" Mmiri ọṅụṅụ na-arụrụ dị omimi n'akịrị mmadụ site n'ispụ atịtị nọ na mmiri Mmiri na-enye akịrị mmadụ ikikere ikwapụ atịtị nọ n'ahụ. Nrị ndị ọzọ na-enye akịrị aka ịrụ ọrụ ọfụma: Ndị ndị nwere Omega 3 ma nwekwa nwere abụba na mmanụ (fatty acid): Azụ titus, salmon na-eso ebudata ọgbụgba ọbara nke Bekee kpọrọ 'blood pressure' ma na-egbochikwa ọrịa akịrị. Potato: Nwere potashiọm na odoma ndị ọzọ, mana potatoes nwereike inwe potashiọm agaghị adịrị ndị potashiọm karịrị ahụ ha mma, ha ga-akpacha anya iri potato. Akwụkwọ nri dịka ọ na-achatụ ojii dịka ụgụ, akwukwọ nri spinach na-enye mmadụ ikikere iwepụ atịtị nri ụfọdụ na-ebute nke Bekee kpọrọ 'anti oxidant' na 'fiber', na ndị ọzọ. Ụgụ na-enye aka echekwa akịrị gị Ụgụ na-enye aka echekwa akịrị gị Apples na-enye aka iwepụtụ nsogbu na-eso ọrịa akịrị. Nwada Patience Chimah sị na mkpụrụosisi deti (date) dịkwara ndị na-arịa ọrịa akịrị. Gee akụkọ mere n'ụwa niile n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" mba-uba-52171525,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-52171525,What is 5G: Gịnị bụ 5G? O nwereike ibutere mmadụ ọrịa?,"Nnyocha Ofcom mere hụrụ na ""radiation"" dị na 5G bu nwa ntịị ka nọkwa n'ime nke a nabatara dịka nke agaghị enye mmadụ nsogbu.","Ndị mmadụ - dịka nwoke putara ngaghari iwe n'obodo Warsaw - na-ekwusike na-ha achọghị 5G Atụmatụ iwepụta 5G mere ka ụfọdụ mmadụ na-atụ ụjọ na o nwereike nye mmadụ nsogbu n'ime ahụ. Mana, Ofcom, bụ ngalaba na-ahụ maka intaneti na Briten, sị na ọnweghi ihe ọbụla ha hụrụ na nyocha ha mere banyere ihe. Olee mba ndị coronavirus metụtara? Eseela Ndị a hụrụ nwere corona n'ụwa niile Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Ebee o si: Mahadum Johns Hopkins, ndị isi mba ahụike na mba Akara mgbe ekwusọrọ ya 11 Disemba 2020, 11:00 GMT+1 data n'uju *Mmadụ ole nwụru kwa otu puku Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Maapụ a na-egosi ọnụọgụ nke ndị Mahadum Johns Hopkins na-edepụta kwa mgbe kwa mgbe, onwereike ghara igosicha ka ihe siri kwuru ugbua na mba ụfọdụ. **Ozi ikpeazụ ndị ọhụrụ bu ọrịa a bụ ngụkọ nke ụbọchị atọ. N'ihi ntụgharị n'ọgụọgụgụ ndị bu ya, ọ gaghị adị mfe ịgbakọ nke ụbọchị a. Ebee o si: Mahadum Johns Hopkins, ndị isi mba ahụike na mba Mgbe edere akara: 11 Disemba 2020, 11:00 GMT+1 Ndị mmadụ - dịka nwoke putara ngaghari iwe n'obodo Warsaw - na-ekwusike na-ha achọghị 5G Ha sị ọkachị ihe ha hụrụ na 5G bụ sọsọ pacentị 0.039% n'ime a sị di mma. Etu ihe a kpọrọ ""radiation"" ga-adị n'igwe intanetị bụ ihe ngalaba akpọrọ ""International Commission on Non-Ionizing Radiation Protection"" (ICNIRP) kwekọrịtara. N'ebe a, ""non-ionizing"" pụtara na ọdịghị emebe ime ahụ mmadụ nakwa ""DNA"" mmadụ. Otu onye na-ekwuru Ofcom sịrị; ""Ihe na-akpụ na ebe anyi nyochara bu nwa ntịị n'etu nkwekọrịta si dị mma na-hụ mmadụ. E mere nyocha na mpaghara iri na isii n'obodo iri dị na mpaghara dị iche iche na Briten etinyegoro 5G. Ha nyochara ike ieh akpọrọ ""electromagnetic field"" (EMF) n'ebe ndị a. 5G si ekwenti o na-ebutere mmadụ ọrịa? 5G onwereike inye mmadụ nsogbu? Ofcom malitere ịgbakọ EMF si igwe ekwentị kemgbe 2003. Mana dịka ụtụtụ ụlọ ọrụ ekwenti na Briten wepụtara 5G n'ime afọ gara aga, Ofcom mekwara nyocha ọhụrụ. Ọ sị na nwepụta 5G mere ka ha tinye uche na nsogbu nwereike soro ya, dika otụtụ mmadụ na-ajụ maka nke a. Ọ sị, ""5G ka bụ ihe na-apụta apụta. Ya mere anyị ka ga-ana emekwa nyocha ma na-ele etu o siri kwụrụ dika a na-aga n'ihu."" Ofcom mere nnyocha ọhụrụ banyere 5G na etu o siri metuta mmadụ, wee hụ na o nweghi ihe o na-eme mmadụ maka na redieshon sị ya apụta dị nwankenke Agbanyeghi ihe ndị mmadu na-ekwu maka ya, ndi okachamara n'ahụike na-ekwusike na onweghi nsogbu dị na 5G dịka o si metụta ahụike mmadụ. Ngalaba na-ahụ maka ahụike mba ụwa bụ nke Bekee kpọrọ ""World Health Organization"" n'aka nke ha sị na ""radiation"" nke sị ""radio frequency"" nwere ike butere mmadu kansa. O tinyere ya n'ofu ebe o tinyere akwụkwọ nri na-aka pawụda. Nke pụtara na mmanya na anụ agbara na kom kom ka ya njọ." afirika-43967105,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43967105,"N'Enugwu, ụbọchị ndị ọrụ kpọtụrụ akpọtụ",Ndịọrụ n' Enugwu steetị sonyere ndị ogbo ha na ụwa nile wee mee mmemme ụbọchị ndị ọrụ na Tuusde.,Ndị ọrụ Naịjirịa na-arịọ gọọmentị ka ha tinyere ha ego n'ụgwọ ọnwa ha N'ogige ezumezu bụ Okpara Square Enugwu ka ndị ọrụ karịrị puku atọ zụkọrọ wee kwụọ n'ahịri na ahịrị. Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyi bụ onye naara mgbucha na oge emume ahụ gwara ndị ọrụ na ọchịchị ya jisiri ike ịhụ na ụgwọ ọnwa na orubere ha nile bụ ihe a na-akwụ oge ọbụla o kwesiri. Onyeisi otu jikọrọ ndịọrụ bụ Nigeria Labour Congress n'Enugwu bụ Viginus Nwobodo kelere Ugwuanyị ka osi na-akwụ ndịọrụ n'Enugwu steeti ụgwọ n'ụbọchị ịrị na atọ na ọnwa ọbụla. Nwobodo gwara Ugwuanyi ka o cheta wee kwụtọpụ ndị ọrụ onwa ịrị na atọ okwere ha na nkwa n'afọ gara aga. Gọọmentị ekweela nkwa n'ụgwọ ọnwa ga-arị elu mgbe adịghị anya Igbokwe Chukwuma bụ onyeisi Trade Union Congress toro gọọmenti Enugwu maka ịmapụta otu narị nde naịra ịji wee kwụọ ndị lara n'ọrụ orubere ha niile. Igbokwe rịọkwara Ugwuanyi ka onye ntuziaka ka ndị na-akwụ ụgwọ ọnwa na-akwụ mịnịstrị na parastatalụ ụgwọ na otu ụbọchi ka ọṅụ ndịọrụ oyibo wee zuo oke. Otutu ndị ọrụ ahu mere mmemme ikwu na ahịrị zọọ ije dịka ndịagha kwuru na nani ihe ha chọrọ bụ ka gọọmentị etiti bunikwuo ụgwọ opekata mpe nke ndịọrụ a na-akpọ 'minimum wage' n'olu bekee. Akụkọ ndị ga-amasị gị 42775973,https://www.bbc.com/igbo/42775973,"""Onweghị ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ""","Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akagbuola akwụkwọ, ndị ezi na ụlọ Nnamdị Kanụ na ọkaiwu ya gbara ịjị rịọ ka ọ manye onye isi agha ala Najiria bụ Tukur Buratai ka kpụpụta Kanu ebe ha dowere ya.","A maghị ebe Nnamdi kanu kamgbe ọnwa September afọ gara aga oge ndị agha wakporo be ya na Afara Ukwu Abia steeti. Jọstis Binta Nyako, bụ ọka-ikpe biri ikpe ahụ kwuru na o weghị anya etu ọnye a sị na a na-achọ achọ sịrị bụrụ onye gbara akwụkwọ ahụ. Ogara na ihu kwuo na ha gara agba akwụkwọ ahụ n' aha Kanụ, kama ị sị na ọ bụ Kanụ tinyere ya. A na- achọ Lani achọ kehbe ọnwa Setemba gbata Ndị otu Indigenous People of Biafra bụ IPOB n'aha ịchafụ ekwuola na gọọmenti etiti na ndị agha soja bụ ndị ji onye isi ha bụ Nnamdi Kanu. Onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful kwuru nke a oge ọ gwara BBC Igbo okwu taa. Ọ kwuru na ndị gọomenti ji ya mana ha amaghị ebe ha ji ya. N'okwu ya - ""Kedụ ka ha ga-esi kweta na ha ji ya, ha mara na nwoke ahụ bụ nsogbu dịrị Naịjirịa, ha chọrọ ikpuchi ya ọnụ"". ""Ha agwaghị anyị ebe ha debere ya, anyị abụghị gọọment, anyị abụghị DSS ma ọ bụ soja, ha bụ ndị mara ebe ha ji ya mana ha ga-akpọpụta ya, ọkwa iwu"" ""Papa ya ma mama ya, onweghi onye mara maka ha, oge ha gara ebe ahụ, agbara gwogwo ebe ahụ, ị ga ebe ahụ, ị ga-ahụ ihe ndị agha mere ebe ahụ"". N'aka nke ọzọ ndị otu IPOB mere njegharị n'aba n'ụbọchị 20 Jenuwarị ime mkpesa gbasara ikpe ọka ikpe Abdul Kafarati kpebiri n'izuka gara aga na IPOB bụ otu na-eyi ọha egwu. Onye nkwuchite ọnụ ndị IPOB Emma Powerful gwara BBC Igbo na njegharị ahụ bụkwa iji cheta ndị ụmụ Biafra ndị agha Naịjirịa gburu n'Igweọcha dị na state Rivers ụbọchị 20 Jenuwarị, 2017. Ọkọlotọ ndị Biafra Ụlọ ikpe kpebiri n'izu ụka gara aga na IPOB bụ otu na eyi ọha egwu dịka ndị Boko Haram. IPOB kwuru na ọka ikpe ahụ ekweghi enye ha akwụkwọ o jiri kpee ya bụ ikpe nagbanyeghi mbọ niile ha gbara iji nweta ya. Ke ịhe okwu a pụtara? Otu IPOB site n'akwụkwọ ha dere nke onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful binyere aka na ya kwuru na ọ gbagojuru ha anya ihe kpatara ọka ikpe ahụ jiri na-egbu oge iweputa akwụkwọ ikpe ahụ. Powerful kwuru na ha gwara ọka ikpe ahụ na ha chọrọ igba akwụkwọ ka e kpegharịa ya otu ụbọchị o kpere ikpe nke ya. O kwuru na ""Ihe a so n'ụzọ a chọrọ iji dọta ndị mpaghara ọdịda anyanwụ na abụghị ndị na-akpọ isi ala n'ike"". Ha kwuru na izu a na-agba emegide ha agaghị akwụsị ha ime ma kwuo na ha chọrọ ka ihe niile bụ ihe gọọmenti etiti wepụtara eji kpee ha ikpe bụrụ ihe ga-eru ha aka n'ụzọ iwu ka ha nwee ike ịga ụlọ ikpe nkpekwa etu ha si chọ. Cheta na gọọmenti etiti kpọrọ IPOB otu na-eyi ọha egwu n'afọ gara aga oge ha bidoro njegharị iwe na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa maka ka e kewa Naịjirịa nye ha ala nke ha bụ Biafra. Gọọmenti etiti zigara ndị agha ndị ji egbe na ngwọagha dị ichiche wee kwụsị ha. Kamgbe ihe ahụ mere, amaghị ebe onye isi ha bụ Nnamdi Kanu nọ." 52426233,https://www.bbc.com/igbo/52426233,Anambra state: Onyeara ewerela anyụike kugbuo nna ya,N'Anambra otu onyeara ewerela anyaike kugbuo nna ya gbara afọ iri asaa n'ụtụtụ taa bụ Satọde n'Umuchiana dị n'okpuruọchịchị Agụata.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na ndị otu ha ejidelarị ya bụ nwaamadị aha bụ Chigorom Ezeofor maka nnyocha. Dịka Mohammed siri kwuo, ọ bụ nwanne nna ya bụ Timothy Ezeofor bịara meera ha ya bụ mkpesa n'isi ụtụtụ taa na ụlọọrụ ha dị n'Aguata. Dịka ọ dere, ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ na asaa anyịwalaarị ara kemgbe afọ asatọ gara aga. O dere na ""mgbe ndị ọrụ anyị buuru Mazi Godwin Ezeofor rụọ ụlọọgwụ ha chọpụtara na-anwụọlarị"". Ha wetekwara ya bụ anyụike ojiri gbuo nna ya. Gee akụọ na ndị ọzọ n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Gee okwu a Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53620522,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53620522,Nigeria Police recruitment: Ị chọrọ ịbụ onye uweojii? Lekwa usoro ndenye aha ọhụrụ,Ndị uweojii Naịjirịa ekwuputala usoro ndị mmadụ gafere agba nke mbụ na njem iwe ọrụ ha nọ n'ime ya ugbua.,"N'agba nke a nọ ugbua, ọ bụ nke ndị mmadu ga na-etinye asambodo ha n'akara ịntanetị ndị uweojii ji ahazi iwe ọrụ a. Dịka ngalaba na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii na ndị ọha siri dee na soshal midia n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jụlaị, ndị na-achọ ọrụ ga-abanye n'ọba ịntanetị www.policerecruitment.gov.ng ma mee ihe ndị a: Ihe ọzọ onye ahụ na-achọ ọrụ ga-eme iji hụ na a nabatara nke ya bụ: Ọ bụ na Fraịde ka ndị uweojii Naijirịa kwuru na ha ga-abanye agba ọzọ n'atụmatụ iwe ndị mmadụ n'ọrụ nke afọ 2020. Ha sị na onye nwere nsogbu kpọọ ekwentị ha bụ 08100004507, maọbụ zie ozi n'email ha bụ e-training@recruitment.gov.ng maọbụ support@policerecruitment.gov.ng." afirika-50002725,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002725,'Gọọmentị Abia steeti jị ndị ABSU ụgwọ enyem aka' - Ụlọomeiwu Abia steeti,Ngalaba ụlọomeiwu Abia steeti na-ahụ maka agumakwụkwọ edepụtala nchọpụta ha maka ego gọọmenti Abia steeti ji mahadum nke steeti e ji ABSU mara.,"Onye n'ahu maka mgbasa ozi na ntaakụkọ nke ndị ụlọomeiwu Abia steeti bụ Jude Ndukwe kwuru na ihe ha nyochapụtara gosiri na gọọmentị Abia steeti ji mahadum ahụ ụgwọ enyemaka ha kwesiri inye ha kwa ọnwa. Ụgwọ a bụ ego ndị gọọmenti steeti na enye ụfọdụ ngalaba nke gunyere mahadum iji kwado ha. Ndukwe kwuru na gọọmentị jị mahadụm ahụ ụgwọ a ọnwa ole na ole. Ka o di ugbu a, ndi ụlo omeiwu ga-enwe nzuko ebe ha ga atule ụgwo a eji ụlọ akwụkwọ ahụ. O kwuru na ihe nwere ike ime ma ha mechaa nnyocha ha gunyere: 1) Ha ga-akpọ Kọmishọna na-ahu maka agumakwụkwọ ka ọ kọwaa ihe mere ha ji jiri mahadum a ụgwọ. 2) Ha nwekwara ike inye ikike ka gọmenti steeti kwụo ụgwo a niile. 4) Ha nwekwara ike itụnye aro ka ewetuo ụgwọ enyemaka a, ka gọọmentị steeti nwee ike ịkwụ ya. Ahọpụtabeghị ndị ga-arụ ọrụ dịka ndị komishọna n'Abia steeti. Gụo akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya" media-53184565,https://www.bbc.com/igbo/media-53184565,Abiola Ajimobi: E liela Abiola Ajimobi chiburu Oyo steeti,E liela gọvanọ chịbụrụ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi taa bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun n'Ibadan Oyo steeti.,"Enwebeghị onye ma ebe ha liri ya kama e kpeere ya ekpere pụrụ iche n'elekere iri na abụọ nke ehihie iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun. Ọtụtụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara ekpere nakwa mgbaru maka ọnwụ ya. Abdullahi Ganduje bụ ọgọ Ajimobi nakwa gọvanọ Kano steeti, gọvanọ Jigawa steeti nakwa osote gọvanọ Legọs steeti so na ndị bịara olili Ajimobi Ndị mmadụ gbakọrọ maka olili Ajimobi Dịka ọtụtụ ndị Naijiria ọnụ na-eru n'okwu na-atụ arịrị maka ọnwụ Ajimobi, Gọọmenti Legọs steeti agbaala ama na ọ bụ ọrịa Covid-19 gburu ya. Ajimobi, onye bụbu Gọvanọ Oyo steeti nwụrụ ụbọchị Tozde (June 25, 2020) n'ụlọọgwụ First Cardiologist Consultant, dị na Legọs bụ ụlọọgwụ ebugara Abba Kyari tupu ọ nwụọ. N'ozi nke Kọmishona ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi wepụtara n'abalị Tọzde na Twitter, o kwuru na Ajimobi nwụrụ n'ụlọọgwụ nọrọ onwe ya a mapụtara maka ileta ndị bu ọrịa coronavirus. O kwuru na ""Aka chịburu ọyo steeti nwụrụ dịka ọrịa coronavirus kụchara akụkụ ahụ ya dị oke mkpa ịnjini."" Akụkọ ọnwụ Ajimobi bụ ihe a na-atụpụ murmuri n'ehihie Tozde dịka ọ pụtara ihe n'ihi egwu idahie dịka akụkọ na ọ nwụrụ wuburu na soshal midia izu ole na ole gara aga, o mechaa ọ bụrụ akụkọ ụgha. Ọ bụ nwunye nwa ya bụ Fatima Abiola bụ onye gwara BBC na ọ bụ ezie na ọdachi ahụ mere eme. Dịka ozi pụtara si kwuo, a gaghị elikwa Ajimobi onye gbara afọ 70 n'obodo ya bụ Ibadan, Oyo steeti taa bụ Fraide dịka e higharịrị ya dobe ya ụbọchi Satode (Juun 27,2020). Cheta na izu ole na ole ghara aga, akụkọ fegharịrị bụ na Ajimobi, onye otu APC họpụtaburu na nsonso a dịka onyeisioche ha n'etiti nwụrụ. Nke a na eme dịka akụkọ wuru na soshal midia n'abalị ise nke ọnwa Juun na ọ na-arịa nnukwu ahụ, e buga ya ụlọọgwụ mana o doghị anya ihe na-arịa ya. Ihe aga- eji echeta Ajumobi: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 45022713,https://www.bbc.com/igbo/45022713,Ụlọikpe akwụsịla ịṅụ iyi ọrụ Ekenze dịka osote gọvanọ n'Imo steeti,Ụlọikpe nọ n'isi obodo Imo steeti bụ Owere akwụsịla idu iyi ọrụ e kwesiri idu Calistus Ekenze dịka osote gọvanọ steeti ahụ.,Ekenze kwesiri ịnọchị Eze Madumere bụ onye akụkọ pụtara ụnyaahụ na a chuturu ya n'ọkwa ahụ ebe ọ bịaghị zara ọnụ ya maka akwụkwọ a gbara ya. Ikpe ụlọikpe ahụ bịara taa dịka a chọrọ ibodo idu Ekenze iyi ọrụ ahụ. Imo Steeti: Ọfọrọ ọnwa atọ ka achabie ikpe Madumere Ọkaikpe steeti ahụ bụ Miletus Nlemadimgwara ndị gbakọrọ maka mmemme idu iyi ọrụ ahụ maka ya bụ ikpe nke mere e jiri kwụsị ya bụ mmemme. Cheta na nchutu e mere Eze Madumere mejọrọ iwu ụlọikpe nyere n'ụtụtụ ụnyaahụ ịkwụsị usoro nchutu ya. Ọkaikpe Ben Iheka nyere iwu ka a kwụsị usoro niile e ji maka nchutu Madumere rue mgbe a ga-eme mkpesa maka ikpe ahụ ma kpezie ya. Mana ndị ụlọomeiwu steeti ahụ gara n'ihu chutuo ya ụnyaa. Madumere kwuru na ya ga-aga ụlọikpe maka nchụda ya. BBC Igbo gbara mbọ inweta ụlọomeiwu Imo ka a mara ihe ga-emezi mana onweghi ony zara oku. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-45183151,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45183151,Nigerian Senate: Kedu ka o si kwụrụ taa?,Ihe ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa tinyere uche na ya bụ ịma ma ndị ụlọomeiwu aga alagachite ọrụ.,"Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti Ndị omeiwu nke ukwu na ogbo ha na nke nta gara ezumike ọnwa abụọ n'ụbọchị 24 nke ọnwa Juun, nke mere ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari na gọọmentị ya bido iti mkpụ na ya bụ ihe ga-emebiri ha ihe ha na-ahazi, ọkachasị nke metụtara ntuliaka nke afọ na-abịa. N'agbanyeghị na onyeisiala na-arịọ ka ha laghachite ọrụ tinye ọnụ n'ego ndị Inec ji eme ntuliaka ahụ nakwa ego ọ chọrọ ka e tinye na bọjetị nke afọ a, ndị omeiwu ka nọkwa enwe anwụrị ezumike ha. Ụfọdụ n'ime ha agaala njem. Onyeisiala na onweya nọ mba ofesi na aracha ezumike nke ya. Taa, ebumnobi ọtụtu mmadu bụ na ndị ọmeiwu ga-ezukọ n'obi ha, rachaa mkpụrụ aka ma binye aka n'iwu, mana Okeke ahụghị azụ Azụka. Ihe Igbo na-anụ bụ na ọ bụ ọgụ na mgba chere ụlọomiwu n'ihu. Saraki hapụrụ APC laghachị PDP Ndị nọ n'otu akụkụ bụ ndị otu pati na-achị bụ ndị Bekee kpọrọ All Progressives Congress (APC). Ndị kwụ n'akụku ọzọ bụ ndị Peoples Democratic Party (PDP) bụ ndị a chuturu n'ọchịchị n'afọ 2015. Ndị PDP na-ebo ndị APC na ha na-akpa nkata etu ha ga-esi chụtuo onyeisi ndi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki. Ndị APC adịghịkwanụ agọ ya bụ ebubo, makana onyeisioche ha bụ Adams Oshiomhole na-ekwusi ike na ya bụ nchụda ziri ezi, ma kwukwaa na Saraki kwesịrị ịkwanyere onweya ugwu rituo n'udo. Saraki n'onweya kwuru na onweghi ebe o ji azụ aga. Ọgbaghara mere n'ụlọomeiwu n'izu gara aga so n'ụmụ kepu kepu na-adapụta n'ịtụaka a. Okwu ọbụzi ịma mbe n'abọ nke bụ oke? PDP kwụsị ike na onweghị ebe Saraki na-aga ma ọ bụrụ na ọbụghị ihe ruru mmadụ 76 tinyere aka n'ịchutu ya. APC enweghị ihe ruru mmadụ 76 n'ụlọomeiwu ukwu. Ugbua, ọ bụzi ndị APC na-eti mkpụ na ewu na-achọ ịnọ n'ụdọ mụo nwa. Ha sị na ndị PDP na-achọ ịba ndị otu ha ọgụ n'ụlọomeiwu. BBC Igbo gbara Ike Abonyi bụ onye ndụmọdụ mgbasaozi nke onyeisioche PDP bụ Uche Secondus ajụju ọnụ maka ihe a ndị APC kwuru. Abonyi gwara BBC Igbo na a maghị PDP maka ịchọ okwu maọbụ ịlụ ọgụ. ""Ọ bụ ndị APC ka a ma maka mgbasa ozi asị. Ihe a ha kwuru bụ ihe Bekee na-akpọ propaganda,"" Abonyi kwuru. N'aka APC, BBC Igbo jụrụ Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị APC na Legọs, ihe ọ hụrụ n'okwu ndị pati ya kwuru maka ịchutu Saraki. Igbokwe sị na yabụ atụmatụ ga-adị ire makana ha nwere ikike ime ya. ""Ọbụghị eziokwu na anyị ga-enwe mmadụ 76. Ị ma na anaghị ezucha...e ruo 80, ndị ka ga-ewepụnwu Saraki,"" Igbokwe kwuru, ma tụọ ilu sị na onweghị ebe e si aga Ọnịcha ọ dị nso. Akụkọ a ka dị n'ekwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45140561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45140561,Ụlọomeiwu ga-agbakọ n'izuụka n'abịa,Ụlọomeiwu nta na ukwu ga-apụta n'ezumike afọ ha n'izuụka n'abịa ma nwee ọgbakọ maka bọọjetị nta akpọrọ 'Supplementary budget' na bekee.,"Osote onye na-ekwuchitere ọnụ ụlọomeiwu nta bụ Yusuff Lasun bụ onye gwara ndị ntaakụkọ ihe a n'Abuja O kwuru ""anyị na ngalaba n'ahụ maka ntulika bụ Inec enwela nzụkọ imeụlọ, ya mere n'anyị nwereike ị gbakọ n'ụbọchị tuusde maọbụ wensde n'izuụka n'abịa"" Ihe ndị ha ga-eleba anya n'ọgbakọ ha gụnyere ego INEC ga-eji hazi ntuliaka nke 2019, nakwa mwakpo ndị DSS mere ụlọomeiwu n'ụbọchị ole na ole gara aga. Laolu kọwara na ezumike ndị ụlọomeiwu gara bụ nke kwesiri ekwesi n'ọbụghị nke aghụghọ dịka ụfọdụ mmadụ na-eche. National Assembly: Ndị DSS gbochiri ndị omeiwu ibanye ụlọọrụ ha Cheta na ndị uweojii pụrụiche bụ DSS gbochiri ụfọdụ ndị omeiwu ị banye n'ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tuusde nke bụtere ọchụchụ onyeisi ha bụ Lawal Daura. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49490974,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49490974,Dora sị m na ọ nwụọ mụ kwaa ya ọfụma - Chike Akunyili,Dora Akunyili nwụrụ site n'ọrịa akpụ bụ 'Cancer' kemgbe afọ 2014.,"Tupu ọ nwụọ, ọ bụbu onyeisi ụlọọrụ Nafdac nakwa Mịnịsta mgbaozi ochie Naịjirịa. Di ya bụ Dọkịta Chike Akunyili gwara BBC etu ha sị jekọrịta na mbụ na etu o si echeta nwunye ya nwụrụ. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a. Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51443129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51443129,EFCC vs T.A Orji: 'Anyị ka na-enwe mkparịtaụka maka ihe anyị ga-asa ụwa'- Ọnụ na-ekwuru Nwa T.A Orji,Ọnụ na-ekwuchitere nwa onye bụbu gọvanọ Abia steeti ekwuola na nwamgbe nta ha ga-apụta gwa ụwa okwu gbasara nnyocha EFCC na-enyocha T.A Orji na nwa ya.,"Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu. Uzoma Okoro kwuru na ha ga-akpọ ndị ntaakụkọ oku mgbe ha di njikere ikwu okwu. Ihe wuru ụbọchị itoolu nke Februwarị niile bụ na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) na-enyocha nde kwuru nde achọpụtara n'ọbaego Chinedum Orji, nwa aka chiburu Abia steeti bụ Theodore Ahamefula Orji. Mana ọnụ na-ekwuru T . A Orji ekwuola na ha ga-ekwu okwu gbasara ya bụ ebubo n'oge na-adịghị anya. Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade kwuru na ya bụ ebubo bụ nke otu a kpọrọ 'Save Nigeria Group' depụtara n'akwụkwọ mkpesa ha wepụtara kamgbe ọnwa Maachị nke afọ 2017. Akwụkwọ ebubo ahụ kwuru na T.A Orji, oge ọ bụ gọvanọ Abịa steeti, nwetara ma bubaa n'akpa ya ego e kenyere ya iji rụpụta ihe na steeti ahụ. Lee ụfọdụ ego e depụtara n'akwụkwọ mkpesa ahụ 'Save Nigeria Group' depụtara na ha chọpụtara ọba ego ruru otu narị bụ nke Chinedum Orji nwa Theodore Orji. Mana Orilade kwuru na ụlọọrụ ha ka na-enyocha ya bụ ebubo. Anyi ga na-ege ntị ka anyị mara ihe ha nyochapụtara. Cheta na n'afọ 2018, EFCC kwuru na ha na-enyocha ụmụ T.A Orji maka ego ruru nde iri abụọ na asaa (N27bn). Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-53104216,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53104216,2nd Niger Bridge: Ihe mere ndị Ogbaru ji chọrọ ịkwụsị ọrụ n'Akwammiri Naịja,"Kamgbe afọ 2018 gọọmentị etiti malitere ịrụ akwammiri Naịja nke abụọ, ọtụtụ nsogbu adapụtala n'etiti ndị obodo Ogbaru dị n'Anambra Steeti na ndị orụ.","Etu ọrụ si aga n'Akwammiri Naịja nke abụọ Ndị Ogbaru sị na ndị ọrụ ngo ji akwammiri ahụ bụ Julius Berger manyere aka n'ala ha dị n'akụkọ ebe ahụ na-enyeghi ha ego itiaka n'obi ọbụla. Nke mere ha jiri mee ngagharịiwe n'afọ 2018 sị na gọọmenti etiti na ụlọọrụ Julius Berger ga-akwụ ha ego itiaka n'obi dị nde narị naira ise. Mana ọ dịka a ga-asị na nsogbu a mere ka ọ jụọla oyi amalitela ọzọ n'ụbọchị ole na ole gara aga. Ugbua, ndị Ogbaru akpọpụla gọọmenti etiti, ụlọọrụ abụọ gụnyere Julius Berger na B and Q Dredging n'ụlọikpe ukwu dị n'Awka, Anambra steeti. Ihe na-ewe ndị Ogbaru iwe Ndị Ogbaru gụpụtara ụfọdụ ihe ndị na-ewe ha iwe dịka; Ndị Ogbaru sị ka gọọmenti etiti, ụlọọrụ Julius Berger nakwa B and Q Dredging ka ha mee ihe niile a ha chọrọ maọbụghị ya na ha ga-ewe iwu ma kwụsị ha ọrụ. Onye na-anọchite anya mịnịstrị ọrụ n'Akwammiri '2nd Niger Bridge' bụ Ajani Razaaq Adeyemo gwara BBC Igbo uche gọọmentị banyere nke a. Ọ sị na ọ bụ eziokwu na ndị Ogbaru na-esi ọnwụ ka a kwụọ ha ego itiaka n'obi kama kwuo na ọrụ ka na-agakwa n'ihu ebe ahụ. Adeyemo kwere nkwa na a ga-arụcha akwammiri a n'ọnwa Febụwari 2022 dịka e ji yie ya na-agbanyeghi ọnwụ ndị Ogbaru na-esi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42971172,https://www.bbc.com/igbo/42971172,Akpọghachịla Usman Yusuf: Buhari nọ na nsogbu,Okwu na-ewu taa bụ mkpọghachị onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari kpọghachịrị onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka mpaghara ahụike a na-akpọ NHIS bụ Usman Yusuf.,"A na ekwuzi na Buhari akwusighị ike na agha mpụ maka o dizi ka o na eme ima mmadụ Okwu Yusuf Usman bu ihe entinyere anya maka na afọ gara aga, Minsta na ahu maka ahụike bụ Isaac Adewole nyere Yusuf ezumike ọrụ, ma hazikwa ndị nyocha ka ha tinye anya n'ọrụ Yusuf na-arụ na mpaghara ọ na-achị. Akwukwọ o dere o jiri nye ezumike ike ruru Yusuf aka n'abalị isii n'ọnwa Jụlị 2017. O kwesiri ịnọ ọnwa atọ na ezumike ahụ, mana ndị kọmitii na-ahụ maka ahụike na ụlọ ome iwu nke Naịjirịa nke nta tinyere ọnụ na okwu a, wee si ka akpọghachị Yusuf. Onye no ni isi Komiti a bu Chike Okafor. Ha kpebiri n'aka Yusuf dị ọcha, ma sikwa na ọ mmegide ka Minista nke arụike na-emegide ya maka ọrụ ọ na arụ banyere etu ndị HMO (bụ ndị na ahazị etu e si akwụ ụgwọ maka arụike na Naịjirịa) si arụ ọrụ. Okafor na Komiti ya kpebiri ka ewepụ nkwụsi ọrụ a enyere Yusuf nakwa ka-etinyere ha onye nchekwa. Mana, ka aka nọ na-eche ka a mara ka Minista arụike ọ ga eme ihe Kọmiti a kwuru, ndị nyocha ọ haziri wepụtara nchọpụta ha, nke kpebiri na Yusuf mere mpụ n'ụlọ ọrụ ya. Ndị nyocha si na aka Yusuf di n'ego ruru N919 nde bụ nke ojiri aghụghọ nweta. Ha si na Yusuf mere ka ọ bụ ya ""kachasị jide ọfọ, ma na azụ ha, o so na-amịkpọ NHIS"". Maka Usman Yusuf Onye na ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Femi Adesina gwara BBC Igbo na ya amaghị maka mpọghachịa emere Yusuf, ma kwuo na ọ minista ahụike ga-aza aziza dị n'ime ya. BBC Igbo gbara mbọ inwete Minista arụike ka o kwuo ụche ya gbasara okwu a, mana ekwenti ya gbaṅụrụ agbaṅụ. Kedu ka esi ahụzi aghaa na-ebuso mpụ? Ka akụkọ mpọghachị a emere Yusuf putara ihe, ndị mmadụ na Twita na Facebụk bidoro ikwụpụta iwe ha banyere ya. Ọtụtụ mmadụ na ekwu na ihea Buhari mere gosiri n'onweghị mgbe o ji chụọ ibuso mpụ na aghụghọ agha etu o si na-ekwu. Ụfọdụ ndị ọzọ na ekwu na ya bu mkpọghachị gbara ama ụdị mmadụ Buharị bụ. Mana, onwekwere ndị kwenyere na ihe a Buharị mere, na akọwa na NHIS na-ada ada." afirika-45374748,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45374748,Lee ka Pope ụka Katọliki si chie Bishop ọhụrụ n'Enugwu,"Na agbanyeghị mmiri ozuzo malitere n'ụtụtụ tata zobe, puku kwụrụ puku ndị mmadụ zukọtara na St Pauls parish Ozalla iji gbaa aka ebe ka echiri ụkọchukwu Ernest Obodo, Bishop.","Oge a na-ebikwasa Bishop ọhurụ aka echichi Onyeisi nchụ aja ya bụ mmemme ichị nnukwu Ụkọchukwu bụ ọnọchite anya Pope Francis na Naịjirịa eji ""papal nuncio"" wee mara na olu bekee bụ ụkọchukwu Antonio Guido Filipazzi du ndị Bishop karịrị iri atọ wee bia ya bụ mmemme. Filipazzi bikwasara Ernest Anaezichukwu Obodo aka n'isi, kpube ya okpu, nye ya mkpara, nyekwa ya ngọzị na ikikere nke pope wee chie ya Bishop nke abụọ a na-akpọ ""Auxiliary Bishop."" Bishop ahụ ga na-enyere Bishop Callistus Onaga ịrụ ọrụ ịchekwa igwe atụrụ nọ n'ụka katọliki n'Enugwu. Ndị ụkọchukwu biara ị hụ ya bụ emume Bishop Obodo kelere ndị ụka niile nyere ya nkwado, kelee Bishop Onaga, ndị ụkọchukwu ibe ya na ndị echiri echịchị ndị ọzọ gbakọbara na St Paul Ozalla Nkanu west. Ndị sisita bịara ya bụ mmemme Gọvanọ na-achị Enugwu bụ Ifeany Ugwuanyi, Gọvanọ chiburu Anambra bụ Peter Obi na ọtụtụ Igwe mmadụ juputara bịara ya bụ mmemme. Ndị ama ama biara ọgbakọ a. Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kọwara obi ụtọ ha na ụka na-abawanye na agbanyeghị mmekpa ahụ. Ha nyekwara Bishop ọhụrụ, Ernest Obodo ndụmọdụ ka oṅomịrị ụkpụrụ Christ mgbe niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-47956900,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47956900,Barcelona vs Man United: A fọjuola Man Utd ose Nsukka n'ọnụ,Ekwe kụrụ ndị Manchester United n'isi ka ndị Barcelona gbakọrọ aka tee ha ure n'ọgbọegwuregwu Nou Camp.,"De Gea a na-atazị aja? N'ime ọkara nke mbụ, Lionel Messi ji ọkpụ goolu abụọ kara aka dọkaa neetị David De Gea ka ọ bụ dike ọgụ n'agha na nkeji 16 na 20. Man Utd malitere ọfụma ka egwu bidoro, kpatu ike ka ndị chị ọkụ bịa, mana isi ha apụtaghị. Barcelona zuru ndị Man Utd ike n'ahụ, iji gwa ha na ha anabataghị ha n'azụ ụlọ ha ka ha bịa were ha gwuo egwuregwu. Na-erughi nkeji iri abụọ e ji malite ọkara nke abụọ, n'ime nkeji 61, Philippe Coutinho si n'ezi igbe goolu fanyere De Gea ""aka eru"". Alexis Sanchez nke Man Utd nwara ike ya iji isi takpuo bọọlụ na nkeji 90, mana Marc Andre ter Stegen bụ ochegoolu Barcelona sị ya ""ọ bụghị taa"". Barcelona ji mkpokọta ọkpụ goolu anọ asataghị otu merie ma chụpụ Man Utd Etu ọ dị ugbua, a gbaalara Manchester United ụgbọ nwamkpi isi na Champions League pụọ. Ebe Barcelona ga-ezute onye meriri n'etiti Liverpool na Porto, n'agba nke ọkara-ikpeazụ. Chee aka ghọrọ ihe ga-eme mgbe ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44911970,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44911970,A nwụchiela 'ụkọchukwu' chọrọ ịkpọlite ozu nwụrụ anwụ,A nwụchiri otu onye chọrọ ịbụ onye amụma n'Ethiopia ka ọ nwachara ike ya ma daa ka ọ na-achọ ịkpọlite otu nwoke nwụrụ anwụ ebe ahụ.,"Ezinaụlọ ahụ nyere ya ikike ịga n'ihu ka ọ kọchaara ha akụkọ Lazarus nọ n'akwụkwọ nsọ Getayawkal Ayele dinara n'elu ozu onye a kpọrọ Belay Biftu na-eti ""Belay, teta"" ka ọ na-achọ ikpọlite ya. Ọ bịaghị na mmezu, nke kpasuru ezinaụlọ ahụ iwe ma mee ka ha bido iti Getayawkal ihe. Ndị uweojii bịara zọpụta ya, mana o meghị ka ọ laa na nta n'aka ha maka na iji ozu nwụrụ anwụ mee akaja bụ mpụ n'iwu mba Ethiopia. Otu onye isi ndị uweojii na mba ahụ gwara BBC na ha anwụchiela nwoke ahụ ezigbo ọrụ ya bụ ịrụ ọrụ ahụike nke Bekee kpọrọ 'health worker'. Ndị mmadụ setere ihe a ka ọ na-eme ma tinye ya na soshal midia, ebe ọtụtụ mmadụ kesara ya. Ndị bi n'ọbere obodo a kpọrọ Galilee, dị na mpaghara Oromia, kwuru na Getayawkal bu ụzọ gakwuru ezinaụlọ ahụ na-eru uju ma kọọrọ akụkọ Lazarus nke akwụkwọ nsọ kwuru na Jesu Kristi kpọlitere n'ọnwụ. Ha kwenyere ka e gwulite ili Belay. Mana ka ọ na-akpọlitenwughị ya, ọtụtụ ndị ezinaụlọ ahụ kubiriume ebe ndị ọzọ ji iwe bido iti Getayawkal ihe tupu ndị uweojii abịa kpụrụ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43565645,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43565645,Ntuliaka 2019: Atiku Abubakar chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala,Onye bụbụ osote onyeisiala Naijirịa bu Atiku Abubakar ekwupụtala na ya ga-eso zọọ ọchịchị ka onyeisiala n'afọ 2019.,"Atiku so na ndị gwuzobere APC Atiku bụrụ osote Olusegun Obasanjo mgbe o rịrị oche ọchịchị site 1999 ruo 2007 kwuru nke a na Portharcout ụnyaahụ dịka ọ kwuru na ya ga-azọ ọchịchị ahụ n'okpuru pati PDP. Atiku na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na PDP gara Rivers Steeti ka ha na ndị isi PDP na steeti ahụ nwe mkpakọrịta. Content is not available End of Facebook post, 1 Ọtụghị ndị mmadụ n'anya na Atịkụ kwụpụtara ebụmobi ya banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 maka na a na-anụbụ kepukepu ya kemgbe ọ hapụrụ APC laghachi PDP n'afọ 2017. Atiku n'onwe ya kwuru na ya na-enwepụta onwe ya ka onye ga-etinye Naịjirịa n'ụzọ ọhụrụ site n'ihe o kwuru bụ ""ọdịda nnụkwụ APC"". Atiku kwuru na kemgbe 2015, gọọmentị APC mebiri akwụkwọ ahụike na ọrụ ndozi obodo site na-anaghị etinye ego na ha etu okwesiri. ""Kemgbe 2015, onwebeghi ụzọ ruru kilometre 100 gọọmenti APC rụrụ ebe ọbụla n'ala anyi,"" Atiku sịrị. Onwerike ọbụrụ Buhari na ga-anọ n'isi ndị ndọrọndọro ọchichị nke 2019 Ọ tụkwala aka na ya na-eche na APC ayasala udo na ịdịnaotu nke ndị Naịjirịa nwere. ""Ahụbeghị m ka ndị Naịjirịa si otua kewa n'atụmatụ okwukwe, asụsụ nakwa ebe e si. Nkewa a sitere n'aka APC na etu ha si chịbie,"" Atiku kwuru. Ndị APC asabeghị ya okwu a mgbe BBC Igbo dechara akụko a. Okwu Rochas banyere ọchịchị Buhari Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo Mana, Atiku bụ onye mbụ pụtara kwuo na ya ga-azọ ọchịchị ka onyeisiala na atụmatụ pati abụọ aha ha na-ada ụda na Naịjirịa bụ PDP na APC. Agbanyeghị na ndị mmadụ na-ele anya na Muhammadu Buhari ga-apụta zọ ọchịchị iji mara ma a ga-enye ya agba nke abụọ, okwubeghị ma ọ ga-etinye ụkwụ na ya bụ ntụliaka 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52552560,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52552560,Ndị ntọ atọọrọla otu onye ntaakụkọ n'Ụmụahịa,Ndị ji egbe atọọrọla otu onye ntaakụkọ na-arụ na redio nke Federal Radio Corporation of Nigeria (FRCN) dị n'ụmụahịa aha ya bụ Chinenye Iwuoha n'abalị Monde.,"Akụkọ dị mkpa taa: A tọrọ Iwuoha na nso Amakanma Estate dị n'Ụmụahịa, oge ya na onyeisi ndịọrụ bụ Uche Ndukwu na mmadụ abụọ ndị ọzọ na-ala ọrụ. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ntọ ahụ chere na ọ bụ Iwuoha bụ onyeisi ọrụ n'ime ndị nọ n'ụgbọala ahụ kwọ ha ala nke mere ha jiri kpụrụ ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Abia bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ha ma maka ya bụ ihe kama na ụlọọrụ FRCN ewetabeghị mkpesa ọbụla nye ndị uweojii banyere ya. Akpachaghị anya, gọọmenti etiti ga-agbachi obodo ọzọ- NCDC Chikwe Ihekweazu bụ onyeisi NCDC Ihekweazu, onyeisi NCDC bụ otu na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria agwala ụmụ Naijiria ka ha kwado maka mgbachi obodo kpamkpam ma ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus gbalie. Ihekweazu tụrụ arịrị na ọtụtụ ndịmmadụ anaghị agbaso ntuziaka gọọmenti naa-etu a ga-esi gbalahụ ikesa ọrịa cọrọnavirus. Ụgbọelu kpọkasịrị na Somali Mba Kenya a kpọọla oku ka e nyochaa ihe mere ụgbọelu bu ngwa ọgwụ kpọkasịrị na mba Somalia n'ehihie Monde. Otu ụgbọelu mba Kenya kpọkasịrị ma gbuo mmadụ isii nọ n'ime ya ụbọchị Tuzde. A ga-eme asọmpi nkeji iri anọ na ise ka ọ bụ nkeji iri itoolu? Gordon Taylor Bụ onyeisi otu PFA N'egwuregwu, dịka a na-eche ịmalitegharị egwuregwu Premier League n'ụbọchị asatọ nke ọnwa June, ọtụtụ echiche na-apụta maka ịgbazụ asọmpi niile nke ahapụrụ n'agba nke 2020. Onyeisi ndị 'Professional Footballers Association' bụ Gordon Taylor na-eche ma ọ ga-aka mma igbuji asọmpi na nkeji iri anọ na ise karịa nkeji iri itoolu dịka ọ dị ugbua." afirika-56661009,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56661009,"Imo State News: Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazigharịghị nchekwa ọwụwa anyanwụ, ESN ga-eguzosi ike",Ọkammụta Law Mefor akatọla mwakpọ ndị omekome wakporo ụlọ ọrụ ndị uweojii n'Ehime Mbano .,"O kwuru na ya bụ ihe gbagọjuru anya ma na-eme ihere. O kwuru na ndị uweojii ekwesighị ịgbapụta ozigbo bowe ndị otu Ipob ebubo maka ya bụ mkpa mkpa kama ha kwesiri iwepụta ihe gbara ọkpụrụkpụ gosiri ndị mere kpara ya bụ ajọ agwa. O kwuru na ọ dịmma ka ndị gọvanọ na ndị ọnụ na-ekwu nọrọ n'ọgbakọ , kpaa maka inweta ezigbo ndị nchekwa obodo ga-echekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ. O kwuru na ihe mere Nnamdi Kanu ji hibe Eastern Security Network bụ makana ohere enweghị nchekwa dapụtara na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Mefor kwuru na ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazịghị nchekwa obodo ọfụma, ESN ga-eguzosi ike. Etu e si gba ụlọọrụ ndị Uweojii ọkụ n'Ehime Mbano Ụlọ ndị uweojii nakwa ọtụtụ ụgbọala dị n'ogige ahụ ka ndị ekperima gbara ọkụ. Ihe ruru ụgbọala iri na abụọ na otu ọgbatumtum ka ndị ekperima lara n'iyi oge ha wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ehime Mbano n'ụbọchị Tuzde. Ndị mere mwakpo a gbarikwara ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma tọhapụ ndị niile e ji eji, dịka ndị obodo si kwuo. Mwakpo a mere ka ọ gachara awa olemole Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gara Owerri, isi obodo Imo steeti, iji anya ya hụrụ ihe e mebiri oge ndị ekperima wakporo isi ụlkọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ mkpọrọ dị n'Owere n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde. Chetakwa na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu gakwara Owere n'ụbọchị Tuzde ka o were anya gbaara onwe ya ekeresimesi, mana ọ ka nọ n'Owere oge ozi pụtara na Onyeisiala Muhammadu Buhari agbaneela ya tinye onye ọhụrụ. Oge ya bụ mwakpo mere n'Ehime Mbano na mgbede ụbọchị Tuzde, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, kwuru na ọ bụ ụgbọala atọ ka a gbara ọkụ. Mana mgbe BBC gbara ụkwụ ebe ahụ n'ụtụ Wenezde a, anyị hụrụ na ụgbọala gbara ọkụ mere nkarị. Dịka Orlando Ikeokwu si kwuo, onweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na mwakpo ahụ. Ụgbọala a gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii n'Ehime Mbano Ndị uweojii ekweghị ka ndị ntaakụkọ anyị see onyonyo ọbụla, mana ha gbara mbọ isete foto ndị a dị n'akụkọ a. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ekperima ahụ tọhapụrụ ndị e ji eji tupu ha zunye ogige ha ọkụ. Ụlọ ndị uweojii nakwa ọtụtụ ụgbọala dị n'ogige ahụ ka ndị ekperima gbara ọkụ." afirika-53325461,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53325461,Naira Devaluation: Gịnị ka ọ pụtara maka ndị nkịtị?,Ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) ebutuola ego Naịjirịa ka ọ bụrụzie naịra narị atọ na iri asatọ (N380) maka otu dọla.,"E ji pasentị 24.6 butuo ya site na N360 ọ dịbu na mbụ. Nke a na-abịa dịka ọrịa coronavirus nakwa ihe ndị ọzọ na-emekpa akụnaụba Naịjirịa ahụ. Ọnụahịa mmanụ agbidi nke bụkarị ihe na-enye Naịjirịa ego, na-ada ada na mbaụwa. Nke a mere ka akụnaụba Naịjirịa na-agbadakwa agbada. Ọtụtụ ndị ọkachamara dị icheiche ekwuola uche ha maka mbutu naịra bụ nke Bekee kpọrọ 'devaluation'. Ụfọdụ sị na ọ bụ ihe e kwesịrị ime, ebe ndị ọzọ sị na ọ ga-eme ka ahụhụ na ihe isi ike kawanye njọ. Onyeisi ụlọakụ etiti, Godwin Emefiele Mmadụ dịka Sanusi Lamido, bụbu onyeisi CBN, kwuru na ya bụ mbutu naịra adịghị mma n'oge a, mana Kingsley Moghalu, onye rụburu ọrụ dịka osote onyeisi CBN, sị na ọ ka mma ka e butuo ya. Mana ndị nkịtị aghọtachaghị ihe okwu a bụ 'devaluation' pụtara maọbụ etu ọ ga-esi metụta ego akpa ha. 'Devaluation' ọbụ ihe ọjọọ ka ọ bụ ihe ọma Mbutu naịra ga-eme ka ọnụahịa ihe gbalie elu bụ nke bekee kpọrọ 'inflation' Chidi Lemchi, onye ihe banyere ego na akụnaụba doro anya, kọwara na mbutu naịra mara mma ma jọkwaa njọ. Lemchi kwuru na ""mbutu ego ga-eme ka ọnụego mbubata ngwaahịa gbalie, nke ga-eme ka ọnụahịa ihe niile gbalie"", bụ nke Bekee kpọrọ 'inflation'. ""Ọ ga-emekwa ka ibite ego raa ahụ maka na ndị na-ebinye ego ga-etinye ego na ọmụrụnwa ha na-ana."" Nke a pụtara na ndị ihe ga-esiri ndị nkịtị ike karịa ka ọ dị na mbụ. Devaluation nwere ike ime ka ndị si mba ofesi bata Naịjirịa bịa tinye ego ha, nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee ọrụ Mana Lemchi kọwara na ya bụ 'devaluation' nwere ike ime ka ndị si mba ofesi bata na Naịjirịa ma tinye ego ha, maka na ọ ga-eme ka ọmụrụnwa ha gbalie. ""Ọ bụrụ na ọtụtụ ụlọọrụ si mba ofesi bata Naịjirịa mepee ụlọọrụ ha ebe a, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ nweta ọrụ."" Ya bụ na mbutu naịra ga-eme ka ọnụahịa ihe oriri na ihe ndị ọzọ gbalie, mana ọ ga-akara akụnụba Naịjirịa mma n'ọdịnihu." 45703219,https://www.bbc.com/igbo/45703219,#NigeriaAt58: Ihe ndị mmadụ mere iji cheta ụbọchị a,Ọtụtụ mmadụ ka na-ekwuputa olileanya ha nwere na ebe Naịjịrịa nọ dịka ọ gbara afọ iri ise na asatọ.,"Ụmụakwụkwọ na-echeta ụbọchị October 1 na Naịjirịa n'ụzọ puruiche @BashirAhmaad bụ onye na-eme ihe niile gbasara onyeisiala n'elu soshal midia gosiri ihe nkiri a ebe ndị agha kwụ n'aghịrị zọọ ije. End of Twitter post, 1 @obyzeks kwuputere olileanya ọ ka nwere n'Obodo Naịjirịa ma yiri uwe gosiri na Obodo ya na-amasị ya. @bukolasaraki kwuru kelere ụmụ Naịjịrịa, ma jiri ohere a na-ayọ ka onye ọ bụla bie n'udo. @CIPHER_RR kwuru na ihe nkiri a ga-eme gị ị mara na ị hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu. @BennyCapricorn ji foto a egosi ihe mberede dị iche iche na-eme n'akụkụ Naijiria dika a na-eme emume ncheta a. @KADAssembly ji ohere a ekele ndị isi mbụ chiburu anyị. Onyeisala Muhammadu Buhari kwuru na nagbanyeghị ihe isi ike Naịjirịa na-agabiga, ọ ka na-aga n'ihu. O kwuru nke a mgbe gụpụtara ozi ụbọchị ncheta nwereonwe Naijịrịa. Buhari kwuru na ọchịchị ya meriela mpụ na aghụghọ nakwa ndị agha Boko Haram. Ihe ise dị mkpa o kwuru: Gịnị ka October 1 pụtara: Ọ bụ taa ka Naịjirịa nwetere nwereonwe ha n'aka ndị ọchịchị nke Mba Britain. Ọ bụ Abubakar Tafawa Balewa onye nwụgoronụ bidoro ọchịchị nwereonwe Naịjirịa. Mana ka afọ atọ gachara, Naịjirịa bụrụzịa rịpọblik ebe Nnamdị Azikiwe bụ onyeisiala mbụ chiri na ya bụ Rịpoblik. Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala nke mbụ chiri Naịjiria ka ọ họchara ripọblịk. N'afọ 2010, Naịjirịa mere emume ncheta nwereonwe ha nke afọ iri na ise nke a na-akpọ ""Golden jubliee."" Ndị agha na-eme emume maka ncheta nwreonwe Naịjịrịa Taa Naịjirịa dị afọ iri ise na asatọ. Taa ka eweturu ọkọlọtọ nke ndị Britain bụ ""British Union Jack"" na Naịjirịa ma welite ọkọlọtọ ""green white green"" nke Naịjrịa. Mgbe ezenwaanyị ala Britain na-agụ ozi ya n'ụbọchi nwereonwe Naịjirịa Ọ bụkwa taa ka e wepụtara iwu ala nke ndị Naịjirịa ga-eji na-achị onwe ha. Ndị ọchịchị Britain wepụtara ngalaba atọ dịka nke Ọwụwa anyanwụ, ugwu Hausa, nakwa Ọdịda anyanwụ. Kamgbe ahụ, ụbọchị October 1 abụrụla emume ndị Naịjirịa na-echeta ma tule ihe niile gbasara ọchịchị,akụ na ụba, mmekọrịta na nwulite ha dịka Obodo. Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu Soshal: @Muhd_Taofeek ji ohere a wee bụọ abụ ala nke Naịjiria ma nye onwe ya olileanya na iheọma ka dị n'ihu na Naịjịrịa. @aazailani_jr na-enwekwa aṅụrị n'elu twitter. @TheCeoNigeria na-enyekwa onwe ya nnukwu olileanya na Naịjirịa ga-adịmma ọzọ. @KADAssembly kwuru na ọ gaghị echezọ ahụhụ ndị chibụrụ Naịjirịa na mbụ tara. Mana ndị nke a nwere echiche ọzọ:‏ @MartinsChicruz sị na ọ bụ ncheta nwereonwe nke ahụhụ na ihe ọjọ dị iche iche juru kamgbe afọ iri na ise gachara. @legendarytunde ji taa gụputa ihe niile na adịghị mma na Naịjiria. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44639524,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44639524,'Ihe tinyere m n'ọnọdụ a' - Onye eboro na ọ tụrụ ogbunigwe na be Nwodo,Otu n'ime mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchịrị maka ogbunigwe atụrụ na be onyisi ndị Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo agọọla aka na ọkpa.,"Onye eboro ebubo Ekene Okechukwu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo mgbe ndị uweojii kpụpụtara ya na ndi ọzọ ha nwụchịrị na aka ya adịghị na ya bụ mkpamkpa. Cheta na ndị uweojii sị na Okechukwu na onye ha si bụ onye otu ya aha ya bụ Amah Gabriel bụ ndị tụrụ ogbunigwe n'ulọ Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo na April 29 afọ a. Gabriel gọrọ sị na ya abụghị onye ohi, na nani ihe ya mere bụ izịgara chief Nnia Nwodo ozi na-ekwentị ya kwa mgbe kwa mgbe na abara ya mba ka ọhapụ ụmụ Ipob aka. Okechukwu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na aka ya adịghi n'ihe a mere, ma kwukwa na ya bụbụ onye uweojii. kọmishọna uweojii n'Enugwu bụ Dan-mallam Mohammed onye gosipụtara ndị ahụ n'ihu ndị ntaakụkọ kwuru na ha ga-ekpochapụ ndị ji egbe aga ohị nakwa ndị omekaome dị icheichen'Enugwu. Amah sị: ""A na m arịọ mgbaghara n'ihi na amaghịm onye Nwodo bụ, ọ bụ n'igwe okwu nke Biafra ka m nụrụ akara ekwentị ya were zipụ ozi ahụ."" Nwodo na onye uweojii Cheta na atụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo n'obodo Ukehe n'Enugwu n'ọnwa Eprel. Ndị IPOB gọrọ n'aka ha adịghị n'okwu ahụ. Ndị otu ndị aka ji ndị uweojii kpọpụtara igosi ndị ntaakụkọ dị ise Otu ndị ohi ha jidere dị ụzọ ise. N'aka ọzọ, ndị uweojii gosikwara otu nwoke bụ DSP n'prison ya na ndi otu ya na ekweghị ndị Enugwu ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ya bụ Dsp aha ya bụ Collins Ugwu bụ onye ejidere ebe ha na-ezu ohi ma napụtakwa ha ụgbọala ha zuru ezu. Ya bụ onye ọrụ prisons na ndị otu ya na esoro ndị sị na ụlọakụ puta, laa n'ụlọ ha gaa were egbe nara ha yabụ ego, ma gbagbue onye ahụ ọtụtụ mgbe. Onye isi abaokpu ọzọ ejidere bụ michael Anthony onye Aninri, nke tachịrị obi tọrọ nwata akwụkwọ Ifeyinwa Ugwu na 13 May 2018, machaa ya elu n'ike ma gbuo ya, lịkwaa ya na obere ili. Onye ohi ọzọ bụ ndị jị keke napep ebu ngwongwo ndị mmadụ bụ Amoke Mathew na Solomon Nwankwo ndị sị Abakalịkị. Ejidere ha ebe ha bụ Armored cable ha zuru n'ohi were na aga ebe ha ga ere ya. Ohi Armoured cable bụ nke na ewu ewu n'Enugwu ugbua nke na ha na-aga na ọtụtụ ụlọ nta akụkọ n'Enugwu ga bechasịa ya bụ ụdọ ejị agbasa ozi. Otu nwatakịrị dị afọ iri na isii aha ya bu Nzubechukwu, ka ejidere dịka onye na edobere ndị otu ya egbe, igwe computer, ekwe ntị, ego nakwa otụtụ ihe ha zuru ezu. Komishọna Dan-Malam kwere nkwa na ndị ajọ mmadụ enweghị ebe ezumike n'Enugwu steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-53623888,https://www.bbc.com/igbo/media-53623888,Arsenal vs Chelsea: Egbe Arsenal agbakasiala Chelsea isi rie ha ka anụ Sallah,"Chelsea na Arsenal gwọrọ onwe ha ịba taa n'asọmpi iko FA n'ọgbọegwu nke Wembley dịka Arsenal gbagoro ya ugboro iri na atọ (13) ya, Chelsea nke ugboro itoolu (9).","Ya bụ egwuregwu malitere n'ike na ebube dịka Chelsea nyere goolu mbụ ha na nkeji nke ise site n'aka Pulisic. Ọ dịka ya ha bụ oke iyi riru Pierre-Emerick Aubameyang nke bụ na ahụghị ụkwụ egwu ya anya n'ime nkeji iri abụọ n'isi amalitere bọọlụ ahụ. Mana chi Arsenal zara ha oku dịka e nyere ha penariti na nkeji iri abụọ na isii bụ nke Aubameyang nyere, mere ya bụ egwu jiri kwụrụ na 1-1. Ọ dịka Aubameyang o ji aghụghọ ghọta penariti ahụ maka na ahụ ya na nwoke ahụ emetuchaghị. Mana Chi ya zara ya ekpere. Ya bụ goolu mere ka Arsenal Kelie mezia ka Chelsea daa mba nwamgbe nta. Mana mgbe abatara ezumike, Chelsea lọghachitere n'egwu. Na nkeji nke iri anọ na itoolu Christain Pulisic meruru ahụ nke mere ejiri were Pedro gbawee ya. Aubameyang zakwara aha ya ụzọ na nkeji iri isii na asaa site n'itinye goolu ọzọ nke mere ya Arsenal 2 - 1 Chelsea. Ọkpa Aubameyang dị ọkụ na mgbe a. Ọnwụ ndị Arsenal gburu ka arụrụ aka na nkeji iri asaa na anọ mgbe Mateo Kovacic nke Chelsea gbatara 'red card' site na 'yellow' abụọ ọ nwetere. Mgbe ahụ, Chelsea ji mmadụ iri agba, Arsenal nwere mmadụ iri na otu." media-52888528,https://www.bbc.com/igbo/media-52888528,Majek Fashek: Etu o si nwụọ na ihe ndị ị na-amaghị maka ya,Onye otiegwu ama ama bụ Majekodunmi Fasheke ana etu 'Ọdọmiri' bụ 'Rain-maker' na Beke alakwụrụla ndị nna ya ochie.,"Majek Fashek: Etu o si nwụọ na ihe ndị ị na-amaghị maka ya Aha egwuregwu ejiri mara ya bụ Majek Fashek. Nke a sị na olu onye nhazị ọrụ ya bụ Omenka Uzoma n'ụtụtụ a. Uzoma kwuru na hohaa na ọbụghị coronavirus gburu Fashek makana oteela o ji arịa ahụ. O kwuru na ọ nwụrụ n'Amerịka n'ehihie nke ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun. Ihe ndị ịkwesiri ịma maka ya Majekodunmi Fasheke eji Majek Fashek mara bụ oti egwu na ode egwu dara ụda n'oge 80's na 90's rukwa ugbua. Egwu mbụ buputere ya bụ ọbọ egwu akpọrọ 'Prisoner of Conscience' nke gụnyere egwu wetere Fashek ọtụtụ nturuugo akpọrọ ""Send Down the Rain"" Egwu ahụ mere ka akpọwa ya ọdọ mmiri. Amụrụ ya n'Edo steeti n'afọ 1963 n'ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị. Majek chọbụrụ itipụta egwu ụka tupu ọ nwụọ dịka onye nhazi ya bụ Uzoma si gwa BBC. Etu egwu ya si metụta Afịrịka Ọ na-agụkarị egwu na-eweta udo na njikọ aka. Onye nhazi Fashek kwuru ka ndị mmadụ ga gere ọbọ egwu ""Weep not Children"" makana Fashek ji egwu ahụ wee kwuputa ka ihe ndị gbagọrọ agbagọ n'Afịrịka na etu a ga-esi dozi ya. Uzoma kwuru na ọ chọrọ ka gọọmenti Naịjirịa kwanyere Fashek ugwu site n'ime ka ụbọchị ncheta ọmụmụ ya bụrụ ụbọchị ịṅụ ọnụ maka Majek Fashek. N'okwu ya, "" ọ ga-adị mma ka ndị Naịjirịa na ụwa niile were ihe ọma, mkpalite mmụọ ndị Afịrịka, ihe o mepụtara were na-echeta Fashek."" Ọ Lụrụ nwaanyị, kedụkwanụ maka ezinụlọ ya? Aha nwunye ya bụ Rita Fashek onye ọ gụrụ egwu akpọrọ ""Without you."" Ha mụrụ ụmụ anọ mana ha mechara gawara onwe ha n'afọ 2015. Ọtụtụ mmadụ amalitelarị ide ihe na Twitter gbasara ọnwụ ya. Ihe ndị o mere n'ogo mbaụwa Ya na ndị otiegwu ama ama dịka Tracy Chapman, Jimmy Cliff, Michael Jackson, Snoop Dogg, and Beyoncé arụkọla ọrụ. N'afọ 2016, Fashek na so ndị ama ama ruru narị abụọ gụọ egwu a bara ""We Are Not Afraid"" iji wekọta ego nye International Rescue Committee (IRC) na Human Rights Watch (HRW). Udiri egwu o na-eti Ndị Fashek yiri n'egwu gụnyere Bob Marley, Jimi Hendrix, Fela Kuti. O ji egwu Carribean nke akpọrọ Reggae wee malite wee mepụtazia nke ya ọ kpọrọ Kpangolo. Lee ihe ha dere: Dr Sid bụ otiegwu ama ama na Naịjirịa kwuru na o chetara mgbe nne na nna ya ji egwu Fashek akpọrọ Prisoner of Concience na I & I Experience vinyls n'afọ 1989, mgbe ahụ bụ oge mbụ ọ na-anụ maka Fashek. Tolu Ogunlesi bụ onye enyemaka onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari maka mgbasaozi ọhụrụ dere na: N'ozi arịrị nke ya Festus Keyamo bụ Minista steeti nke Niger Delta Affairs sị na: Ụfọdụ egwu o tiri Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44544319,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44544319,Ụzọ 6 gọọmenti ji chọọ igbo mkpa ndị ọchịehi,Nsogbu dị n'etiti ndị ọrụugbo na ndị ọchịehi ataala isi narị puku mmadụ na steeti dị icheiche Naịjirịa.,"Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Ọtụtụ narị mmadụ anwụọla kamgbe ọnwa Jenuwarị afọ a bụ 2018 na ya bụ ọgbaghara na-eme na steeti Benue, Platu, Kadụna na ebe ndị ọzọ dị na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nakwa na mpaghara ọdịda anyanwụ. Atụmatụ ọhụrụ gọọmenti etiti wepụtara bụ nke ha kpọrọ 'National Livestock Transformational Plan' na Bekee bụ onye ndụmọdụ otu na-eleba anya na akụ na ụba obodo bụ 'National Economic Council' bụ Andrew Kwasiri wepụtara ya ụnyaahụ n'Abuja. Ndị nọ ngosi ya bụ atụmatụ bụ mịnịsta ọrụụgbo bụ Audu Ogbeh na aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom. Atụmatụ isii ahụ bụ; Steeti ebe atụmatụ ndị a ga-ebido Ọtụtụ ehi na-agagharị n'ime obodo Enugu Atụmatụ ndị a agaghị amalite na steeti niile na Naịjirịa, e nwere steeti ndị ga-amalite ya tupu ndị ọzọ esonye ha. Steeti ndị ahụ bụ; Atụmatụ a gụnyere imebe ebe a na-azụ ehi na steeti ndị ahụ. N'okwu ya, Kwasari bụonye gosipụtara atụmatụ a kwuru; ""E sepụtala ụdị ebe a na-azụ ehi nke ayị gosiri gọọmenti nke gụnyere etu ha ga-adị na etu ha ga-aha na steeti iri ndị ahụ.'' ""Gọọmenti na-ele anya ịkwụsị nchụgharị ehi ma mee ka ha nọrọ otu ebe ka a kwụsị nsogbu ndị ọchịehi na na ndị ọrụugbo na-enwe maka na ha na-azọ otu ebe.'' ""Ebe a ga-arụ maka ehi nwere ndị ga-eri ehi mkpụrụ 30, 40, 150 rue 300 nke a ga-arụ na-ebe steeti ahụ nyere ala mana ọ ga-abụ o pekatampe mkpụrụ ehi 1000 ga-dị n'otu ebe n'ime steeti iri ahụ."" Amabeghi etu ihe a ga-esi rụọ ọrụ rue mgbe o bidoro. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43326975,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43326975,"Champions League: Agbapụrụ Tottenham, Man City agafeela",Juventus meriri Tottenham iji banye n'agba nke anọ ebe Manchester City gafere maka mmeri ha meriri n'asọmpi ha nke mbụ n'agbanyeghị na Basel meriri ha ụnyaahụ.,"Juventus ruru na ngwụcha asọmpi Champions League nke 2016/17 tupu Real Madrid ejiri 4-1 merie ha Juventus nyere goolu abụọ iji chụpụ Tottenham, nke mere ha ji bụrụ otu egwuregwu mbụ si England na-apụ n'asọmpi Champions League nke afọ 2017/18. Son Heung-min nyerela ndị Tottenham goolu na nkeji 39 tupu Gonzalo Higuain asata ya na nkeji 64. Goolu Paulo Dybala nyere na nkeji 67 mere ka Juventus merie ma banye n'agba nke anọ. Oge Ikpeazụ Tottenham rutere n'agba nke anọ bụ n'afọ 2010/11. 2017 bụ afọ mbụ Pep Guardiola bụ onye nchịkọta otu Manchester City na-erughị agba nke abụọ n'asọmpi Champions League n'ime afọ asatọ Basel gbara Manchester City 2-1 ụnyaahụ mana ọkwụsịghị ha ịbanye n'agba nke anọ. Ha ji nchịkọta 5-2 gafere maka na ha gbara Basel 4-0 n'egwuregwu nke mbụ ha gbara na be ha. Onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola kwuru na ndị otu ya ""chefuru etu esi agbanye bọọlụ n'ọnụ goolu"" ka ndị Basel nyere ha ihe bụ mmeri mbụ ha na-enweta n'ụlọ ha kamgbe 2016. Gabriel Jesus bu ụzọ nyere ndị Manchester City goolu na nkeji asatọ tupu Mohamed Elyounoussi asata ya na nkeji 17. Michael Lang nyerela Basel goolu ha nke abụọ na nkeji 71. Nke a bụ ugboro abụọ Manchester City na-eru agba nke anọ nke Iko Yurop maọbụ Champions League. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44042798,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44042798,Uweojii ga-enyocha isi mmadụ puku 130 chọrọ iso ha rụọ ọrụ,Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha ga-enyocha isi mmadụ puku 130 chọrọ isolo ha rụọ ọrụ.,"Osote onyeisi ndị uweojii Naịjirịa niile nke na-ahụ maka nkuzi ndị uweojii, kwuru nke a ka ha na-amalite usoro mkpọbata ndị ọhụrụ n'Abuja. O kwuru na ihe kpatara a ga-eji nyochaa isi ha bụ ka a hụ na onweghị ndị nke na-aṅụ ọgwụ ike na-eri isi. Ihe ruru mmadụ puku otu narị na iri atọ (130,000) tinyere akwụkwọ ịbanye ọrụ uweojii bụ ndị a họpụtara a ga-enyocha isi ha, ebe mmadụ puku isii (6000) bụ ndị uweojii na-ele anya iwe n'ọrụ dịka Kọnstable. Ọ bụghị naanị isi ka a ga-enyocha ha, a ga-enyochakwa ahụ ha iji mara ma ha e nwere obiri n'aja ọcha (HIV), ebe a ga-enyocha ma e nwere ndị nke nwaanyị dị ime. Ndị uweojii na-ekwu na ha enweghị mmadụ ole zuru ịhụ maka nchekwa mmadụ ruru nde abụọ (m200). Ndị mmadụ na-ajụ ma a ga-enyochakwa isi ndị uweojii ndị nke nogoro n'ọrụ ugbua maka mmekpa ahụ ha na-eme ụfọdụ ndị Naịjirịa. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood n'ekwentị ka e nwee ike ịgba ya ajụjụ ọnụ maka nyocha a, mana ọ zaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45264574,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45264574,2019 Election: Ndị Anambra lee ndị ntorobịa chọrọ ịnọchite anya unu,Ọtụtụ ndị ntorobịa n'Anambara chọrọ isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2019 dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyechara aka n'akwụkwọ #NotTooYoungToRun.,"Ụfọdụ n'ime ndị ntorobịa uche ha dị n'ịzọ ọchịchị n'Anambara ziteere BBC Igbo aha ha, na ha chọrọ ịnwa ike ha n'afọ 2019. Lee ndị nke chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Anambara steeti na ntuliaka 2019. Ụlọomeiwu ukwu 1) Jude Ezenwafor dị afọ 42 bụ onye achụmnta ego nakwa onye nnukwu enyemaka pụrụ iche nke gọvanọ Anambara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ezenwafor bụ onye Nnobi chọrọ ịnọchite anya ndị Anambara Sentralụ n'ụlọomeiwu ukwu. 2) Chika Raymond Chukwuma Aniemena dị afọ 36 bụ onye Ọka Saụt. Aniemena chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị ndị Ọka Saụt n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta 1) Amajua Collins Chukwuma dị afọ 28 bụ ọkaiwu. Chukwuma bụ onye Awgbụ chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Nọt/Saụt constituency n'ụlọomeiwu nta. 2) Ike Chinedu Klinsmann dị afọ 40 bụ onye na-eme nakwa enye ọgwụ. Ike bụ onye Umudiọka chọrọ ịnọchite anya ndị Anaocha/Njikoka/Dunukofia constituency n'ụlọomeiwu nta. Ụlọomeiwu nke steeti 1) Okekearu Kingsley Chukwuezugo dị afọ 28 bụ onye ọkaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị. Chukwuezugo bụ onye Enugu-Ukwu chọrọ ịnọchite anya ndị Njikọka 1 constituency n'ụlọomeiwu nke steeti. 2) Chisom Jane Chude dị afọ 30 bụ ọkaiwu. Chude bụ onye Ogboli-Olosi chọrọ ịnọchite anya ndị Ọnịcha Nọt n'ụlọomeiwu nke steeti. 3) Franklin Nwadialo dị afọ 34 bụ onye achụmnta ego. Nwadialo bụ onye Ọssọmala chọrọ ịnọchite anya ndị Ọgbarụ II n'ụlọomeiwu nke steeti. 4) Ibeneme Chuchu Arthur dị afọ 36 bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara mmepe nke Bekee kpọrọ 'development consultant'. Ibeneme bụ onye Agụlụzigbo chọrọ ịnọchite anya ndị Anaọcha II n'ụlọomeiwu nke steeti. 5) Ezenwafor Odera Peter dị afọ 30 bụ onye na-emepụta ihe nkiri na Nollywood. Ezenwafor bụ onye Nnobi chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Saụt n'ụlọomeiwu nke steeti. 6) Tyndale Oforbuike Okoli-Egbo dị afọ 37 na-azụ ahịa n'ibughari ibu. Okoli-Egbo bụ onye Nawfija chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Saụt n'ụlọomeiwu nke steeti. Ị ga-akwado ndị a? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54949334,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54949334,Pretty Mike: Ihe mere m jiri buru ụmụnwaanyị di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba,"Na mkparịtaụka Pretty Mike na BBC Igbo, Pretty Mike sị na o bu ihe ọma n'obi wee buru ụmụnwaanyị ndị ahụ di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba.","End of Instagram post, 1 Ọ sị na o mere ya ka o nye ụmụnwaanyị ndị ahụ obi ụtọ. Pretty Mike kwukwara ọtụtụ ihe maka ndụ ya na mkparịtaụka a. Pretty Mike ka ọ na-akpa ụmụnwaanyị di ime n'afọ ha n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba. Pretty Mike kpọrọ ụmụnwaanyị isii dị ime bia agbamakwụkọ Williams Uchemba na Brunella Oscar were isi na ha bu nwa ya n'otu n'otu. Ka Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii di ime wuchiri, ndị mmadụ wee na-elegharị anya. Mana o bighi ebe ahụ, ha gara n'ọtụtụ igwe soshial midia, kpụrụ ya n'ọnụ, mere ka o wee wukarịa ndị gbara akwụkwọ. Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii dị ime ọ kpọ bia agbamaakwụkwọ Uchemba Williams Onye na-eme ihe nkiri nakwa akpa ọchị a ma ama bụ Uchemba Williams echizuola n'iza di Brunella Oscar. Ha gbara akwụkwọ nke ụka ụnyaahụ bụ Nọvemba 21, afọ 2020 na Lagos n'isi ụlọụka Dominion City dị na Leeki Phase 1. Lee ụfọdụ foto si na agbamaakwụkwọ ha pụta: Uchemba na nwunye ya mere agbara nkwụ ha n'izuụka gara aga. Lee Brunella Oscar Nwolisa bụ oriakụ Williams Uchemba na ihe ị na-amaghị maka ya Brunella Oscar bụzị oriaku ọkpaọchị a ma ama aha ya bụ Williams Uchemba. Foto ebe ha gbara akwụkwọ omenaala wuru ewu ọfụma na soshal midia na ngwụcha izu ụka a n'Alor dị n'Anambra steeti. Nke a mere dịka Uchemba wepụtachara foto ya na Brunella Oscar sere n'elu soshal midia n'oge gara aga wey na-ekwu na oge eruola o ga-eji lụọ nwaanyị. Uchemba mechara kwuo na agbamaakwụkwọ nke ụka ha ga-eme n'ụbọchị Novemba 21,2020. Mana onye ka Brunella Oscar Nwolisa bụzi oriakụ Uchemba bụ? Lee ụfọdụ foto si n'agbamakwụkwọ ha: Kedụ Williams Uchemba na Brunella si zute onwe ha? Ụlọọrụ Naịja Digest mgbasaozi depụtara na Nwolisa kwuru na ọ hụrụ onyonyo Uchemba na Facebook ma zigara ya ozi n'ọba ozi n'afọ 2016 ya makana ọ nụrụ n'uche ya na ọ hụla di ya. N'akụkọ ahụ o kwuru na mgbe ọ gwara ndị ọyị ya na ọ hụla di ya na ha che na ọ na-ayị ara. Brunella kwuru na Uchemba sara ozi ya ma jụọ ebe o si, o mechara gwa ya na o si n'ebe nne na nna ya bụ Nwolisa agaghị ekwe ka ọlụọ nwa ya. Uche mba, Nwunye ya na AY onye ọkpaọchị n'ụbọchị ha gbarankwụ Onye bụ di ya bụ Wiliams Uche Mba? Williams Uche Mba bụ otu n'ime ndị na-eme ihe ejije ama ama na Naijirịa. Mba bidoro na soshal Midịa dịka onye na-akpa ọchị ma mechaa banye n'iti egwu nwa mgbe nta E ji ""I dont like what i hate"" were mara dịka onye na-akpa ọchị. Mba bidoro ""Project One mIllion"" nke ga-enyere ndị mmadu aka ịgụ akwụkwọ, ịmụta aka ọrụ ma ị hụ kwa na ndị mmadụ nwere ebe obibi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 42910067,https://www.bbc.com/igbo/42910067,Oka Iwu: Anyi ga-agba ọsọ ndụ,Onye isi ndị uweojii n'ala Naijiria bụ Ibrahim Idris agwaala ndị kọmịshọna uweojii nke steeti di ichiche ka ha gba mbọ wepụ ngwọ agha dika egbe na mgbọ n'aka ndị n'eche nche akpọrọ vigilante na militia n'olu bekee.,"Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị mpụ na Naijiria Idris gwara ndi kọmịshọna na sọọsọ ndị uwe oji kwesịrị iji ngwọ agha n'ala Najiria, ka ha na-echekwa ndụ ndi Naijiria niile dika akwụkwọ iwu ala sịrị kwuo. Mana BBC Igbo kpọrọ ụfọdụ ndị ọkaikpe na ekwenti. Ha kwuru na atụmatu nke a, nwere ka ọ sị dị. Ndi nche n'eji egbe eji atụ nta Goddy Uwazuruike gwara BBC Igbo na ""ọ burụ na ndị uwe oji na-arụ ọrụ eziri ha, anyi agaghị na-ekwu maka ndi nche di ichiche na Naijiria. Mana ndi uwe oji adaala na ntule atulere ha, ya mere ndi Naijiria ji bido otu ndi nche"" Lanre Lasisi bụkwa onye oka iwụ ọzọ kwuru na ""ndi uwe oji enweghi ike i che ndụ anyi,ya mere anyi jiri bido otu ndi nche. Ọnụ ọgụ ha ezughị oke iche Naijiria, ya mere ndi nche a di ichiche jị dị mkpa"" Mana Idris na ndi uweojii na-ebo ndi nche omume ọjọọ dika ohi. Uwazurike na Lasisi kwuru na ebubo nke a enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ. Uwazuruike kwuru na ọ bụrụ na onwere ndị n'ime ha bụ ndị ohi, ọ bụ ọrụ dịrị ndị uwe oji inwụchi ha kama ị napụ ha niile ngwọ agha." afirika-51065330,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51065330,Biafra at 50 : Ihe mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu egwu egwu,"O meela afọ itoolu Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, sorola ndị nnanna laa n'ọnwa Novemba afọ 2011(1933-2011), mana ude ya ka na-ede na mba niile.","Ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ụmụ Igbo ka kpụ dike a duru Ọwụwa Anyanwụ Naijiria n'Agha Biafra n'onụ ọbụladị ugbua okwu nnwereonwe Biafra nwuuru ọkụ ọzọ. Nke a bụ n'ihi na bido oge ọ bụụrụ onye ndu Biafra rue ugbua, ha ahụbeghị onye ndu ọdịmma Ndigbo churu ụra ka ya. Ọtụtụ ndị okenye Igbo dịka Elliot Uko na-ekwu na ụdị akụ agwụ agwụ nna Ojukwu kpara zuuru ya ịgba ndị Igbo nkiti, nọọrọ onwe ya oge nsogbu butere Agha Biafra dakwasara ha. Mana o tinyere isi ya buru ya. Gee ihe Elliot Uko kwuru mere Igbo ji hụ Ojukwu n'anya karịa: ""Enweghị onye dị ka Ojukwu, enweghị onye ga-anọchinwu ya"" - Uko Agha Biafra furu Ojukwu ihe nile o nwere; oge ya, ọgụgụisi nakwa ego nna ya. Emeka bụ nwa a mụrụ n'obi ọgaranya n'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 1933 n'Ugwu Awusa n'ebe a kpọrọ Zungeru dị na Niger steeti. Nna ya, Louis Odumegwu Ojukwu, onye Umudim, Nnewi, Anambara steeti bụ nnukwu ọgaranya ka ibe ya n'Afrịka. O nwere ụlọọrụ njem ụgbọala ma bụrụkwa onyeisi mbụ nke 'Nigeria Stock Market.' Louis agụghị oke akwụkwọ mana o zigara nwa ya bụ Emeka ụlọakwụkwọ ọkaibe na Naijiria nakwa mba ofesi. Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra' Emeka gụrụ akwụkwọ na 'King's College' na Legọs nakwa na , Lincoln College na mahadum Oxford na mba Briten. Ojukwu si azụ ụlọ banye ọrụ amị n'afọ 1957 n'ihi na nna ya akwadoghị ya. Oge ahụ, ọtụtụ na-ahụta ọrụ amị dịka ọrụ ndị enweghị nke ha dị mma ya. Ndiagha zigara ya ọzụzụ na England nakwa Ghana, ma bulie ya n'okwa ka ọ lọghachiri na Naijiria n'afọ 1958. A tụgara ya Kaduna, e mecha mee ya onyeisi ndị agha na Kano. Ọ bụ ka ọ nọ n'Ugwu Awusa arụ ọrụ soja ka Kaduna Nzeogwu, Emmanuel Ifejuna na Adewale Ademoyega na ndị ọzọ kpara nkata ịkwatu gọọmentị n'ike n'abalị iri na ise ọnwa January afọ 1966. Ojukwu so na ndị mere na mbọ Nzeọgwụ na ndị otu ya gbara nyụrụ ọkụ pịị n'Ugwu Awụsa n'ihi okwukwe o nweburu na ịdịkọnotu Naịjirịa. Agụiyi Ironsi dịka onye kachasị nwe ọkwa na ndịagha Naijiria weere ọkwa onyeisiala mana ka onwa isii gachara, Murtala Muhammed chuturu ọchịchị ya n'ike. E gburu ọtụtụ ndị Agha Igbo welitere isi ma site na ya banye n'ọgbụgbụ ndị Igbo nkịtị n'Ugwu Naijria nke mere ka ọtụtụ ụmụ Igbo gbaa ọsọ ndụ gbalata ala Igbo. Ọ bụ dịka ogbugbu nakwa mgbagbu ndị Igbo riri elu karịa na-enweghị mbọ gọọmenti gbara ibelata ya ka Ojukwu dịka gọvanọ na-achị ""Eastern Nigeria"" kwuru ka ndị mpaghara ọbụla chịwa onwe ha. Nke a mere ka e nwee ọgbakọ ebe ndị isi Afrịka zukọrọ wee tinye ya bu okwu ọnụ. Odumegwu Ojukwu na-agwa ndị omeiwu Biafra okwu Julaị 16 1967 Ọgbakọ bụ n'obodo Aburi nke dị na Gana ka a nọ nwee ya, wee wepụta nkwekọrịta a kpọrọ 'Aburi Accord' nke onye ọbụla n'ọgbakọ ahụ binyere aka na ya. Mana ka ọgbakọ ahụ gachara, Yakubu Gowọn dịka Onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ, jụwapụrụ isi na ihe o kwetara n'Aburi' ma bido agha megịde ndị mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ. Ọ bụ n'abalị isii nke ọnwa Julai afọ 1967 ka Naịjirịa gbapụrụ ọnụ egbe mbụ bidoro agha Biafra n'obodo Gakem dị na Krọs Rivas steeti sokwa n' ""Eastern Region.' oge ahụ. N'ọnụ Ojukwu, ihe o jiri gaa agha bụ "" Iji gbaa mbọ hụ na a napụtara ndị Biafra n'atụmatụ ndị chọrọ ịkpochapụ ha."" Yakubu Gowon bụ onyeisiala NAijiria oge a lụrụ Agha Biafra Agha Biafra nakwa agụụ so ya tara isi ụmụ Igbo karịrị nde atọ. Mana ihe kachasị tụọ mbaụwa n'anya bụ na ndị Igbo site na ntuziaka Ojukwu gbara aka ngwaọgụ lụọ agha ahụ dịka dịmkpa rụọ afọ abụọ na ụma! Kama ịda mba, ha jiri nka na agịrị isi rụpụta ọtụtụ ihe nyeere ha aka dịka ọgbunigwe, igwe na-esi mmanụ agbidị nakwa ihe ịtụnanya ndị ọzọ. Ka agha na-achọ ibi, Ojukwu nyefere Philip Effiong ọkwa onyeisi Agha Biafra ma gbaa ọsọ ndụ gaa Ivory Coast. Ezinaụlọ ya: Alum di na nwunye Emeka Ojukwu na Bianca gbara akaebe na ihunanya amaghị okenye maọbụ agadi Ojukwu bụ mmadụ ọha ma bụrụkwa onye ejighị obibi ezinaụlọ egwu egwu. Ọ lụrụ Bianca Onoh, nwa Christian Onoh, onye bubu Gọvanọ Anambara steeti ochie, ha mụrụ ụmụ atọ. Bianca, bụbụ onye nwetara nzere Agboghọ kachasị mma mma na Naijiria tupu ọ lụọ Ojukwu Mana tupu ọ lụọ Bianca, Ojukwu luburu Njideka, onye ya na ya zutere oge ọ na-agụ akwụkwọ n'ala Bekee. Ụmụ ndị ọzọ Ojukwu mụrụ gụnyere Debe(ọ lala mụọ) na Emeka Ojukwu nke obere, Ebere na Okigbo. Ụwa mgbede ya Ojukwu mechara lọghachi Naijiria oge ọchịchị Shehu Shagari ma soro zọọ ọkwa ọchịchị n'otu NPN n'afọ 1983. A tụnyere ya na ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ na mkpọrọ oge Muhammadu Buhari weghara ọchịchị dịka onye agha. E mecha tọghapụ ya n'ihi na ha atụtaghị ya aja n'ahụ. N'ọnwụ, gọọmenti Goodluck Jonathan nyere Ojukwu nkwanye ukwu pụrụ iche dịka onyeisi agha Ọ bụ ihunanya mere Igbo ji nye Ojukwu echichi 'Ikemba' nakwa 'Dikedịọra mma.' Ka ọ nwụrụ n'ọnwa Novermba afọ 2011, o mere ọtụtụ ndị Igbo anyammiri dịka ha na-atụ arịrị na ""enyi Biafra alaala."" Iji tie ndị mmadụ aka n'obi, Gọọmenti Naijiria n'oge Goodluck Jonathan kwanyeere Ojukwu ugwu zuru oke dịka onyeisi agha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50970138,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970138,Arsenal vs Manchester United: 'Pepe' ndị Arsenal agbaala Manchester United ose n'anya n'afọ ọhụrụ,Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ.,"Pepe nyetere ofu goolu n'asọmpi ahụ Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde. Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal. Pepe nyere goolu nke mbụ ka ọ gachara nkeji asatọ ya bụ asọmpi malitere. Ka ọ gachara nkeji 42, Sokratis Papastathopoulos nyere goolu nke abụọ. Nke a bụ mmeri nke mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ dịka onye nkuzi ndị Arsenal. Mmeri a mere ka Arsenal gbagote n'ọnọdụ ndị nke iri na tebulu 'English Premier League'. Pepe, bụ onye Arsenal ji nde paụnd 72 zụta n'ọnwa Ọgọst ritere nzere ọkacha agba na ya bụ asọmpi. Ọ bụghị naanị na Pepe nyere goolụ na asọmpi a, ọ gbakwara bọọlụ kụrụ n'igwe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Lee emume mgba ndị Imerienwe" 43017679,https://www.bbc.com/igbo/43017679,Tottenham jịrị otu goolu meri Arsenal,Tottenham emeriela Arsenal na asọmpị iko Premiere leaque nke agbara taa.,"Harry Kane bụ onye nyere goolu na asọmpị nke ta Ọ bụ Harry Kane nke Tottemham bụ onye nyere goolu na asọmpị nke a. Ugbu a, Tottemham erigolu bụrụ onye nke atọ n'asọmpị Premier League. Ọ bụ Ben Davies bụ onye nyere Harry Kane bọọlụ tupu onyekwa goolu nke a bụ nke iri abụọ na atọ nke Kane na afọ asọmpị nke a. Asọmpi nke a bụ oge nke atọ a meriri Arsenal n'usoro na afọ nke a. Emeriela Arsenal nke oge atọ n'usoro Ihe mere Ọ bụ na nkeji iri isi na asatọ ka Arsenal nwere ike ị agbata bọọlụ rute nso ebe a na enye goolu. Lacazette te gba mbọ i nye goolu mana mbọ ya niile amịhị mkpụrụ ọbụla. Gịnị ga-eme n'ihu? Asọmpị ọzọ nke Tottenham ga-agba bu na ubọchị iri na isi n'ọnwa Febụrụwarị Arsenal na Man City nwere asọmpị nke ha na ụbọchị nke mbụ na onwa Maachi." 47320444,https://www.bbc.com/igbo/47320444,Atiku Abubakar Address: ihe iri Atiku kwuru taa n'ozi ọ gbasara,"Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu pati PDP gwara ọha Naijiria okwu taa ebe ọ nọrọ rịọ do, do, do ka ha pụta mee ntuliaka ụbọchị Satode na-abịa.","Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP bụbu Osote onyeisiala n'ọchịchị Olusegun Obasanjo Lee ọkpụrụkpụ ọkwụ ndị si n'ọnụ Atiku pụta: 1. Agaala m na mpaghara dị icheiche na Naijiria ebe m gwara ụmụ Naijiria n'ogbe ụnụ ebumnobi m gbasara ime ka Naijiria gawa kwa n'ihu ọzọ 2. Achọrọ m ịgba ụnụ ume ka ụnụ pụta tụọ vootu ụbọchị Satode na-abịa bụ Febụwarị 23 3. Vootu ọbụla dị mkpa 4. Ọ bụrụ na ị tụghị vootu, ihe i na-ekwu bụ ihe dịrị etu ọ dị ugbua 5. Ọdịnaihu Naijiria dị gị n'aka 6. Ike ime ka Naijiria gawakwa n'ihu ọzọ dị n'akwụkwọ ntuliaka gị 7. Atụfula ike gị a site na ịnọrọ n'ụlọ 8. Ekwela ka wuruwuru mee na ị pụtaghị n'ihi na ị pụta, ndị mmadụ pụta n'igwe, wuruwuru agaghịkwa adị ire 9. Ọ bụrụ na i nweghị ọrụ, Satode bụ ụbọchị i nwere ohere ịgbanwe ọnọdụ gị 10. Aga m atụ vootu ụbọchị Satode, pụta soro m tụọ vootu n'agbanyeghị pati ị chọrọ itunyere. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46061710,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46061710,Oshiomhole: Alụmdi na nwaanyị ya na APC ọdabakwara?,"N'ọnwa Juun nke afọ 2018, mgbe pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) họpụtara Adams Oshiomhole dịka onyeisioche ha, o kwere nkwa na ọ ga-ahazi nsogbu ndị dị na Pati ahụ.","Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Ugbua, mkpamkpa a na-anụ n'ime APC mere ka ọ dị ka chi efoghị ọfụma na ngalaba onye na-achị pati ahụ. Ụfọdụ afo ọrụru ndị a sitere na ntuliaka imeụlọ APC mere. Cheta na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari gara n'akara ya na Twitter dee iwe ya maka ntuliaka imeụlọ nke Adamawa steeti, nke nwanne ya nwoke achịtaghị aja na ya. O kwuru na ọ bụ mpụ na aghụghọ mere nwanne ya jiri daa. Okwu oriaku Buhari bịara dị ka mbupu okwute nọchiri awa mmiri, makana akụkọ bịazịrị karịa. Ugbua, Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo na aba mba maka Oshiomhole. Ebe 'ọgbaghara' dị N'agbanyeghị obi onugbu a niile, Bola Ahmed Tinubu bụ onye isi APC na Naịjirịa gburugburu, sị na ọ kwụ Oshiomhole n'azụ gidigba. Tinubu kwuru na pati ha bụ APC kachasị nwee ikike, nke mere na ọ naghị akwado mwepụ onyeisi pati ahụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwubeghị okwu maka ihe a. Mana, ọ naghị etinye ọnụ n'esemokwu dị n'etiti ndị pati n'ihe. BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuru APC na Legọs steeti ajụjụ maka ihe a ọ wee gwa anyi na onweghị ihe na-eme n'APC, kama na ihe na-eme bụ ụdịrị ihe a na-ahụ na pati buru ibu etu ahụ, makana onye ọbụla na-achọ ka ọ nọrọ n'ihu oche. Ọ sị na enweghi onye chọrọ ịnọ n'azụ oche. ""A ga-enwerịrị ndọrọndọrọ makana enweghị onye ga-eke aga n'azụ, ihe niile a bụ ihe ndị na-eme ka e nwee ụdịrị ọnọdụ a. Ọ bụghị ihe ọhụrụ, ọ bụ ihe a na-ahụ mgbe niile,"" Maazị Igbokwe kwuru. Ọ gakwara n'ihu sị; ""Makana ọ bụ APC nọ n'ọchịchị, a ga-enwerịrị ndọrọndọrọ ahụ. Ka ndị mmadụ ghara ị na-asị na enwere ọgbaghara. A ga-edozirịrị ihe niile a. Joe Igbokwe si na enweghị mgbe a ga-etinye mmadụ abụọ dịka gọvanọ, enweghị mgbe mmadụ abụọ ga-abụ onyeisiala. ""Ọ bụ otu onye ga-aga, onye nke ọzọ echere oge nke ya. Ọbụghị ihe adịghị eme eme, ọ na-eme, makana ndigbo sị na ọ bụ onye ji igu ka ewu na-esogharị,"" Igbokwe sị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49220600,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49220600,Anambra Flooding: Idemmiri cherela obodo Umuokpu aka mgba,Ndị obodo Umuokpu nke dị na'okpuru ọchịchi Ọka bu isi obodo Anambara Steeti sị na ha natazị kọnkịrị dịka ide mmiri na wabatakwu ha n'ụlọ.,"Otu onye si obodo ahụ aha ya bụ Uchenna Madubona gwara BBC Igbo na ọnụ ahụghị ihe ọ ga-agwa ntị na ya bụ obodo. Maazị Madubona gwara BBC na ""ọ bụ n'udummiri niile ka ihe a na-eme n'obodo Umuokpụ."" Ọ kọwara na ihe kacha akpata ide mmịrrị a bụ etu ala Umuokpu sịrị nọdụ na ndịda ukwu abụọ. Idemmiri mebisirị ihe ndi mmadu Nkea mere na mmiri na esite n'Ọka na ebụrụ aja dochie awammiri nke na eme ka idemmiri ka njọ. Madubona gwara BBC na ha kpọrọ ndị gbata-gbata ka ha bia were ụgbọ mmiri kpọpụta otu nwoke gbara afọ 108 maka na ide mmiri wakporo ya n'ụlo ya. O kwuru sị; ""Anyị nụrụ na gọomentị ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka. O rue oge ntụliaka, ndị na-azọ ọchịchị ga-abia kwee anyị nkwa, kama ha banye na ọchịchị ha echefuo anyị."" Ihe mmiri a mebiri gunyere ụlọ, ụgbọala, ụbị na anụmanụ ndị obodo a na-azụ. Ihe onyonyo idemmiri mebiri Madubona kwuru na ndị Umuokpu na-agbalị ike ha ịkwusị ide mmiri ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ọ gara n'ihu kwuo sị; ""Obodo anyị abụghịzi ebe obibi maka anụmanu mmiri a gburu biara ree ure na-esi ajọ isị, anụ ọhia dịka agwọ na anụ ndị ọzọ bụzi ndị nwezi obodo ugbua."" ""Dịka ọ dị ugbua, anwụnta juru eju bara abara nke mere na iba na anyụ ndị obodo anyị anya, iba erikwala isi ụfọdụ ndị"". Kọmịsọna na-ahu maka mgbasaozi n'Anambara bụ Don Adinuba gwara BBC Igbo na ọ ga-eme nchọputa maka ihe a. Idemmiri achụpụla ọtụtụ n'ụlọ n' Ọnịcha, Anambara steeti. Lee na akụkọ a ga-amasi gi: Lee ihe Nkịrị ga-amasị gị: Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." mba-uba-43190131,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43190131,China chọrọ idegharị iwu ga-eme ka onyeisiala chitee aka,"Otu Communist bụ pati ọchịchị na mba China chọrọ igbanwe iwu obodo ga-eme ka onyeisiala ha bụ Xi Jinping, nwee ike chịkarịa afọ abụọ.","Kamgbe 1990 ka China tinyere iwu ịkwụsị onyeisiala ịchị ọchịchị gafere afọ ise ugboro abụọ Nke a pụtara na Jinping ga-anọ n'ọkwa ọchịchị karịa afọ 2023 bụ oge ọ kwesịrị iritu. Iwu mba China bụ na onyeisiala agaghị anọfe afọ ise, ugboro abụọ. Jinping dị afọ 64, bụ nwa otu n'ime ndị bidoro otu Communist pati a. O ji nwayọ nawyọ n'arigo tupu ọ bụrụ onyeisiala n'afọ 2013. Kamgbe ahụ, akụnaụba China na-eto ebe mpụ na nrụrụaka na-ada, mana ihe ha anaghị emeta ọfụma bụ ikwado ugwu ruru onye. Dị ka ndị ntaakụkọ Xinhua kwuru, ndị otu pati ahụ kwuputara na chọrọ ịwepụ iwu kwuru sị ""onyeisiala na osote onyeisiala nke ndị China agaghị achị ihe karịrị ugboro abụọ sotere ibe ya"" China ọ na-ejije Afrịka? Ọ bụrụ na Jinping nweta ihe ọ chọrọ, ọ ga-adị ka ụfọdụ mba dị n'Afrịka ebe ndị isiala ha notegoro aka n'ọchịchị. N'afọ 2017, ndị Uganda boro onyeisiala ha bụ Yoweri Museveni ebubo na ọ nyere ndị omeiwu aka azụ iji kwudosie ike ka a gbanwee iwu ga-eme ka ebulie afọ ole onyeisila kwesịrị ịdị ma ọ nọrọ n'ọchịchị. N'aka ọzọ, onyeisiala ndị Rwanda bụ Paul Kagame, zọrọ ọkwa ọchịchị nke atọ ya n'afọ 2017, ka ndị omeiwu gbanwechara iwu ka ọ nabata ịzọ ọchịchị ya." afirika-48947535,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48947535,South Africa - Nigeria relations: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Saụt Afrịka' - Ezeali Jonas,"Okwu banyere ọnwụ erughi eru ụmụ-afọ Naịjirịa na mba ofesi, ọkachasị Saụt Afịrịka so n'ihe akpụ n'ọnụ ugbua.","Ihe karịrị mmadụ puku iri so mee ngaghari iwe maka ""xenophobia"" n'afọ 2015 na Durban Mana Udeji Jonas Ezeali bụ Onowu Ndị Igbo bi na mba Saụt Afrịka, nke a na-akpọ ahụ ekwuola na o nweghị onye lekwasịrị ha anya maka ogbugbu na mba ahụ. Maazị Ezeali si n'agbanyeghị na ogbugbu dị elu na Saụt Afrịka, na ọ bụghị na e bu ndị Naijiria n'obi kama na ndị Naijiria ọ metụtara bụ ihe ndakwasị dakwasịrị ha. Okwu ya na-abịa dịka ụlọomeiwukwu gwara gọọmentị etiti ha manye ọkwa nye ndị Naịjirịa na-aga mba Saụt Afrịka. Ọnọdụ a were bụrụ etu gọọmentị Naịjirịa siri saa okwu ọtụtụ mmadụ na-akpọ dịka ọnwụ erughi eru zutere nwa-afọ Naịjirịa bụ Elisabeth Ndubuisi Chukwu gara njem na mba ahụ. Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka ha chekwa onwe ha na mba ahụ maka oke ogbugbu mmadụ n'ebe ahụ. Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka Ezeali dụrụ ndị Naịjrịa ndụmọdụ ha kwadosie ike tupu ha abịa mba ahụ iji gbalahụ enweghi ọrụ. ""Nsogbu enweghị ọrụ dị elu na Saụt Afrịka, o nweghi onye ga-ahapụ ha nye onye Naịjirịa ọrụ."" Ka Ezeali si kwuo, o nweghị onye ọbụla ya ma a na-ebu n'uche iwakpo makana ọ bụ onye Naịjirịa. N'aka ọzọ, o kwuru na mpụ karịrị na mba Saụt Afrịka. ""Ọ bu ebe dị ka New Yọrk ka a gaeji maa atụ ogbugbu mmadụ na-ame na Saụt Afrịka."" Ebe ọzọ ọ tinyere ọnụ bụ okwu banyere ire ọgwụ ike, bụ ihe ọ si butere ndị mba Saụt Afrịka jiri sị na-agba azụ inye ndị Naịjirịa akwụkwọ ịba mba ha. Lee ihe o kwuru n'uju ebe a: Elisabeth Ndubuisi Chukwu: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Sawụt Afrịka'" afirika-47285449,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47285449,BBC Igbo at one: Igbanwe etu ihe dị na mbụ,Nke a emeela ya otu afọ ụlọọrụ BBC a malitere mgbasaozi dịka otu n'ime ndị e kewapụtara na mgbakwunye BBC W2020 maka ndị asụsụ na-abụghị bekee.,"BBC Igbo at one: Ọ dịka ihere a na-eme ndị mmadụ ịsonye anyị N'ime otu afọ ahụ, anyị etoola, kpọbata ndị ọhụrụ n'ọgbakọ anyị, mee ihe ndị a na-emetụbeghi mbụ makwa hụ ihe ọgbatuhie dị iche iche. Mana n'ime ihe niile a, mụ na ndị otu m ka na-amụta nakwa na-amụgharị ihe, site n'iji ụkpụrụ e ji mara BBC mere ihe ntuziaka. Anyị kụwara akị oyibo Nsugbe anyị nke mbụ - mgbe anyị na nwunye onye ndu ndị Ipob nwere mkparịtaụka, ebe o boro gọọmentị Naịjirịa ebubo na ha ma ebe di ya na-efu efu oge ahụ, nọ. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Anyị aghọtala mkpa dị n'ịrụkọ ọrụ na ndịnootu; ebe otu onye enweghi ikike, onye ọzọ enyere aka, na-agba mbọ ịhụ na ọrụ anyị na-aga siriri werere. Otu ihe anyị atụwaghị anya bụ ụdịrị nkwugide na mmegide anyị na-enweta n'aka ndị na-akwado Biafra na ụfọdụ ndị Igbo ndị ọzọ na-ahụta anyị dịka 'igwe mba' BBC, maka akụkọ gbasara anyị agaghị echefu echefu na iwe si n'agha obodo Nigeria, nke ahụ bụ nke na-araghị ndị mmadụ ahụ ikwenye n'ime ya. Ndị ntaakụkọ BBC Igbo na Joe Igbokwe na-ekwuchitere APC na Legọs steeti na Charles Ogbu na-akwado Biafra sere foto ka ha bịara ndọrịtaụka n'ụlọọrụ BBC Ihe dị mkpa bụ ịmata na nke a bụ mbụ a na-esi etu a agbasa ozi n'asụsụ Igbo, site n'ụzọ mgbasa ozi ọhụrụ. Ma anyị gbara nakwa na-agba mbọ ịhụ na anyị na-agbasa ozi n'ụzọ ziri ezi, bụ eziokwu nakwa nke metụtara ndị Igbo; ka oge na-aga, ndị na-abata n'ọgbakọ anyị na-enwe ntụkwasịobi na okwukwe n'ime anyị. Anyị ezutela ndị ụfọdụ hụrụ ihe anyị na-eme na etu ọrụ anyị si emetụta ndị mmadụ n'ụzọ dị mma, n'anya, n'ime otu afọ a. Otu ọmụmaatụ dị mma bụ etu gọọmentị Ebonyi steeti si tinye aka n'ihe gbasara osimiri nnu Ebonyi nke dị n'obodo Uburu, ka anyị kọchara akụkọ gbasara etu ụmụnwaanyị obodo ahụ na-esi emepụta nnu na ya bụ mmiri. Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Akụkọ ọzọ butere mgbanwe a hụrụ anya bụ akụkọ gbasara Festus Ijeomah, otu nwoke ndị ụlọọrụ na-ahụ maka okporoụzọ bụ FRSC mebiri ụgbọala ya ma jụ imezi ya. Ka anyị mechara akụkọ gbasara ya, ụlọọrụ ahụ gara buru ma mezie ya bụ ụgbọala wee bunyeghachị Festus; ha tinyere ya ihe ruru nde anọ. Nso nso a, anyị gbaziri ndị ọzọ ụzọ site n'iji asụsụ igbo mee mkparịtaụka ndọrọndọrọ maka ntuliaka 2019, na steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ. N'ime otu afọ a garala aga, anyị bu ndị na-abata n'ọgbakọ anyị n'obi; ọkwa maka ha ka anyị ji biri? Kwa mgbe, anyị na-alaghachi, tulee ma chọpụta ụzọ dị iche iche anyị ga-esi mee ihe ka o yie ihe, ọkachasị ebe ọ gbasara igosipụta omenaala Igbo nye ndị na-abata ọgbakọ anyị. Anyị erubeghi ebe anyị che na-anyị kwesịrị iru ugbua, mana anyị na-etinye uchu wee mara na ihe dị ka ụbọchị a n'afọ na-abịa, anyị ga-erugo ebe atụwaghị anya. Gere ihe Igbo bụ ọgaranya na-ekwu maka BBC Igbo" afirika-44993451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44993451,Pope anabatala akwụkwọ arụkwaghịm Archibishop McCarrick maka ebubo mmetọ umụaka,Pope Francis anabatala arụkwaghịm nke Theodore MaCarrick bụbụ archibishop Washington degara ya.,"Archibishop Theorodre McCarrick bụbu fada na New York nakwa New Jersey N'akwụkwọ ozi Vatican depụtara, Fada McCarrick zigara Pope akwụkwọ arụkwaghịm ya n'abali Fraide. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Guardian siri kwuo, e boro McCarrick ebubo mmetọ ụmụaka n'ụzọ mmekọahụ n'izuụka ole na ole gara aga. Akwụsịkwara ya bụ Archibishop ịdụ usoro ekpere kemgbe ụbọchị 20 nke ọnwa Juun iji nyocha ebubo eboro ya na ọ metọrọ otu nwata n'afọ iri anọ gara aga. Nwoke ọzọ tụrụ ya aka na ọ metọkwara ya mgbe kemgbe ọ dị afọ iri n'otu rue mgbe ọ toputere dịka ntorobia. Pope Francis agwala ya si ya ""bie ndụ mwute na ekpere"" rue mgbe a ga-emecha nyocha mara ma ikpe amara ya maọbụ na ọ maghị ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46168807,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46168807,Banky W: Otiegwu chọrọ ịzọ oche ụlọomeiwu nta,"Olubankole Wellington bụ otiegwu eji ""Banky W"" mara, ekwuola na ọ chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nta.","Banky W kwuputere nke a n'elu soshal midia ya, kwuru na ọ chọrọ ịnọchite anya ndị nọ n'okpuru ọchịchị-obodo Eti Osa dị na Legọs steeti. O nweta oche a, ọ ga-abụ onye na-akpa ndị mmadụ obi aṅụrị mbụ ga-enweta ya n'ime oge ọhụrụ ọhụrụ a. Dịka foto dị n'akara Instagram ya si kwuo, ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ""Modern Political Party (MDP)"". Site n'ihe o dere n'elu Instagram ya, o kwuru na ebe e kwuru na ndị ntorobịa enweghị ego ịzọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ e kwuru na ha agaghị emenwu, na ha ga-agba mbọ ime ihe ndị ahụ. O kwukwara na ọ ga-akara ya mma na ọ nwara daa, karịa na ọ nwaghị. Ndị na-eme obi aṅụrị banyere ndọrọndọrọ ọchịchị Kedụ ihe ị che? Ọ ga-azọtanwu oche a? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46008210,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46008210,Nnamdi Kanu anyị na-eche gị na ọkụ mmụọ gị - Arewa,"'Arewa Youth Consultative Forum' akatọọla okwu onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-eji ""ọkụ mmụọ"" lọghachite na Naịjirịa.","Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendu gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji N'okwu onyeisi ha bụ Yerima Shettima gwara ndị ntaakụkọ, o kwuru na Naịjirịa etofeela ụdị mmaja ụmụaka ahụ. Cheta na Kanu mgbe ọ na-agbasa ozi mbụ ya kamgbe ọpụtagharịrị ihe kwuru na ọ ga-eji ""ọkụ mmụọ"" lọghachite Naịjirịa. Mana Arewa akatọọla okwu ahụ, ma kwuo na ịdị n'otu Naịjirịa abụghị ihe otu onye maọbụ otu ga-eleda anya. Shettima kọwara iyi egwu Kanu dịka ""ịgbọ ụja n'efu"", maa ya aka n'ihu ka ọ lọta Naịjirịa bịa kwuo ụdị okwu ahụ. Nnamdi Kanu: Aka m dị ọcha n'ebubo niile N'okwu ya ""Anyị etofeela nke a, Naịjirịa etoola ma gbapụtakwa ihe mmadụ iyi ya egwu. Ihe a bụ obodo otu onye agaghị eleli ịdị n'otu ya anya. ""Echeghi m na Kanu nọ na Jerusalem n'ihi na ahụrụ m ozi mba Izrel wepụtara. ""Mana ọ bụrụ na ọ nọ ebe ahụ, ọbaghị uru ị nọ ebe ahụ ekwu okwu, ya lọta Naịjirịa bịa kwuo ya ka anyị mara na o siri ike."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47150549,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47150549,#EndFGM: 'Ọ fọrọ obere ka ibi ugwu gbuo nwa nwa m',Ibi nwaanyị ugwu bụ otu emume ọjọọ ụfọdụ mba dị n'ime Afrịka ka na-eme rue ugbua.,Ya mere na n'ọnụọgụgụ nke ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ Unicef n'aha ịchafụ jiri gosi na e biela ụmụnwaanyị ruru nde narị abụọ na mba iri atọ ugwu. Nchọpụta ahụ gosikwara na a na-ebi ọtụtụ nwaanyị ugwu tupu ha eruo otu afọ. Otu onye na-azọ oke ruoro nwaanyị bụ Mary Odumeke tinyere ọnụ n'okwu a. Ọ kọwara na ibi ugwu a bụ ihe emere nwunye nwa ya nwoke bụ nke mere ka nwaanyị na nwa ya chọ ịnwụ mgbe ọ gara ụlọọgwụ ịmụ nwa. Ọ gwakwara BBC Igbo na ụfọdụ obodo ekwetaala igbochie omume ahụ mana ha jụrụ ịkwụsị mmemme so ya. Ihe ọzọ o kwuru bụ na omenala Igbo na amaghị ama bụ ihe ndị na-akwalite emume a n'ala Igbo Ihe ndị mmadụ ji ebi nwaanyị ugwu Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị afirika-51053611,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51053611,Lyme Disease: Ihe ị kwesiri ịma maka ọrịa a chịnchị na-ebute,'Lyme disease' bụ ọrịa nke chịnchị ( 'tick arthropod') na-ebute nke nwere ike imetụ ụbụrụ maọbụ bute ịkpịkpa na ahụ mgbu.,"Ọrịa 'Lyme' bidoro iwu na soshal midia dịka otiegwu Justin Bueber gbara ama na ya bụ ọrịa ji ya. End of Instagram post, 1 Ọ na-efe mmadụ ma ọ bụrụ na chịnchị bu ọrịa taa gị ma tanye gị nje bu ọrịa ahụ n'ahụ. Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka ị ṅụ ọbara na-amasị chịnchị ya mere ọ na-anọkarị n'ahịhịa n'ọhịa na-eche anụ ọ ga amado ma mịa ọbara. Ọ na-anọkwa anụ ụlọ nwere anumanụ dịka nkịta, ewu, atụrụ maọbụ nwamba. Chịnchị nwekwara ike izo n'akwa,oche nakwa ụlọ adịghị ọcha. Ọrịa 'Lyme' na-akpa ike na mba Amerịka ugbua, ebe e nwere ya mbụ na mba Briten n'afọ 2019. Mana dịka Dọkịta Bayo Onajole siri kọwaa, e nwere ike ịhụ ya bụ ọrịa n'ime obodo na Naijiria. Onajole, onye bụ ọkammmụta ahụike ọha na mahadum 'Lagos University Teaching Hospital(LUTH) kọwara n'ọrịa na-adịkarị ""n'ime obodo ebe ndị mmadụ na-ewu ụlọ ata n'ihi na ọ bụ ụdị ebea ka ahụhụ na-ebu nje ọrịa na-amụba."" Njirimara ọrịa 'lyme disease' Dịka ngalaba na-ahụmaka mgbochi ọrịa na mba Amerịka bụ CDC siri kọwapụta na websaitị ha, ihe ndị e ji ama onye ọrịa 'lyme' ji gụnyere; Ọgwụgwụ ọrịa 'Lyme' Dọkịta Ọnajole kwuru na a na-eji ọgwụ 'antibiotics' ekpochapụ ọrịa 'lyme' n'ahụ onye ọ na-eme. Ihe i nwere ike ime iji gbochie ibute ya Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51172112,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51172112,UK-Africa summit: Etu Britain nwereike isi chụta Africa ka nwaanyị,"E mechaa Brexit, Briten ga-achọ ikwalite ọnọdụ azụmahịa dị n'etiti ha na Afrịka, mana dịka a na-eme nnukwu nzukọ n'etiti UK na Afrịka na Lọndọn, Matthew Davies na-ajụ ma Afrịka ọ ga-erite uru ọhụrụ n'ime ya?","Ndị na-arụpụta mmanya na mba Saụt Afrịka ga-achọ ka gọọmentị ha kwekọrịta maka ụzọ ka mma isi ebubata mmanya ha n'ahịa mba Briten Ihe gbasara azụmahịa nwere etu ọ dị. Nkwekọrịta azụmahịa na onwe ya gbagọkwuru agbagọ. Mkparịtaụka gbasara etu nkwekọrịta a ga-esi abịa kacha taa akpụ. Mana a gbakatala ụkwụ n'ụzọ Brexit ga-esi tinye aka kemgbe, na oge na ha aga. Mgbe UK ga-esi na 'European Eunion (EU)' apụ na ngwụcha ọnwa Jenụwarị a, o nwere naanị ọnwa iri na otu iwepụta atụmatụ azụmahịa ga-adabara ha na ndị EU, iji zere ịlaghachị n'iwu World Trade Organization (WTO). Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na ndị ọzọ nke Bekee kpọrọ 'foreign' Secretary', Boris Johnson gara mba Gana n'afọ 2017 Boris Johnson bụ Praịm Mịnịsta na ndị na-akwado atụmatụ ya ka Briten si EU pụọ, na-ekwukarị maka uru dị n'ọpụpụ, nke gụnyere ikike iji aka ha ekwekọrịta n'ọnọdụ azụmahịa ndị ụmụ amaala ha. Iso na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere uru na ọghọm. N'eziokwu, ị ga-ekwenye n'ụfọdụ ihe ma gbanwee nzube gị ka ya na atụmatụ ndị ọzọ kwekọrịtara n'ime ya dabanye. Mana ị ga-enwetekwa ikike ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'okwu nkwekọrịta azụmahịa. Uru Naịjiria ga-erite na Brexit Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị ọzọ nọ na Lọndọn na-akpa maka nkwekọrịta a, ịmata etu Naịjirịa na ndị ọzọ ga-esi rite uru. BBC na Abubakar Ali bụ onye ọnụ na-eru n'okwu kpara maka uru Naịjirịa ga-eritenwu, o kwuru sị: Kedụ ọnọdụ Afrịka ga-anọ? Alok Sharma bụ onye na-ahụ maka mmepe obodo mba Briten na ndị ozọ, na-enwe nchekwube na mmekọrịta Briten na Afrịka ga na-apụ ọkụ, n'ụzọ gụnyere azụmahịa, iji ego achụ ego nakwa itinye ego n'azụmahịa a ga na-eme aghara aghara. Gọọmentị Briten bu ya n'obi ọfuma. E nwereike ịhụta ọgbakọ itinye ego n'azụmahịa nke UK na Afrịka na-eme ugbua dịka nkọwa ezigbo ebumnobi ahụ, mana mgbanwe ọbụla nwereike ịbịa ga-ete ezigbo aka tupu ọ bịa. Gịnị ga-agbanwe mgbe Briten ga-apụ na EU? Enweghi ihe ga-agbanwe na ngwụcha Jenụwarị a. A ga-ekwu ọtụtụ okwu n'ọha ma mee ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mana ndị Briten ka ga-abụ onye otu 'EU Customs Union' ma sorokwa n'ahịa ha, ruo na ngwụcha afọ. Enwere atụmatụ ka a dọtịa ya rukwuo afọ abụọ, mana ọ dị ka ihe Johnson agaghị eme. Ọ pụtara na nkwekọrịta maka azụmahịa dị n'etiti Briten na Afrịka ga-anọ etu ọ nọ ruo afọ 2020, n'okpuru nkwekọrịta EU na mpaghara ahụ nwere. Gịnị ga-eme ma 2020 gachaa? Ụfọdụ nkwekọrịta azụmahịa dị n'etiti Briten nweterela Brexit na ụfọdụ mba dị n'Afrịka ka ga-adị etu ọ dị ma 2020 gachaa. Ya bụ na ọnọdụ azụmahịa dịka (ego ole a na-ana, oke ole a na-eketa, ụkpụrụ ahịa dgz) ka ga-abụ ihe ọ bụ n'etiti ụfọdụ mba Afrịka nakwa ndị EU. Ịma atụ, n'ọnwa Septemba 2019, Briten na mba ndị si mpaghara ndịda-anyanwụ gụnyere Saụt Afrịka, Bọswana, Namibia, Lesoto, Mozambik na eSwatini a ma dịka Southern African Customs Union (Sacu), banyere na nkwekọrịta azụmahịa. E mere ya ka o dewe ihe n'ọnọdụ ọ nọ n'ime nkwekọrịta mba ndị ndịda-anyanwụ Afrịka na EU nwere. Ọ dị ka nkwekọrịta EU na Sacu nwere. Dịka Liz Truss bụ onye na-ahụ maka azụmahịa mba Briten na ndị ọzọ si kwuo, nkwekọrịta a ""ga-ekwe ka ndị azụmahịa ka nwee ike na-azụ ahịa ma Brexit mechaa, na-enweghi mgbochi ọbụla"". Briten na ihe ruru mba 70 ọzọ ha na EU nwere nkwekọrịta a, ekwekọrịtakwala. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: ""Ihe anyị chọrọ ka Theresa May mere anyị""" afirika-47554510,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47554510,'World Wide Web' agbaala afọ iri atọ,"Mbido ""world wide web"" a ma dịka www, nọ na-ata arụ maka ihe ndị dịka ihe bekee kpọrọ ""dial-up tone"", websaịt ndị kpụkọrọ akpụkọ, CD e ji amụta ihe ndị a na-enye n'efu, nakwa ihe ndị ọzọ ga","Berners-Lee kpara nkata mụtara ""world wide web"" n'afọ 30 gara aga na-atọ ọchị ugbua. Afọ iri atọ taa, Tim Berners-Lee tinyere akwụkwọ mụpụtara ""world wide web"". Iji mee ncheta ọmụmụ ""www"" a, ndị malitere iji ya mee ihe oge ọ malitere, ndị ụlọọrụ teknụzụ, nakwa ndị lara ezumiike nka site na ndọrọndọrọ ọchịchị, banyere Twitter ebe ha ji #Web30 na-echeta ihe mbụ ha mere n'elu ""world wide web"". Lee ụfọdụ ndị tinyere ọnụ n'okwu a: Al Gore bụbu osote onyeisiala mba Amerịka, so n'ime ndị kwuru okwu. N'afọ 1994, Bill Clinton bụbu onyeisiala mba Amerịka na Carl Bildt bụ praịm minista mba Swidin mgbe ahụ, bụ ndị isiala mba mbụ bu ụzọ zie ozi n'elu www. Mgbe o ruru afọ 2000 bụ afọ ụlọọrụ nyocha Pew dị na mba Amerịka nyochara mmadụ ole na-eji ịntanetị eme ihe, ihe karịrị ọkara mbaụwa amalitela iji ịntanetị. Ọ ga-ara ahụ ichefu ụdịrị mkpọtụ ""dial-up"" ahụ na-eme mgbe gboo ahụ. Ndị Google tinyere ya n'ihu ọrụ ha iji mee emume ncheta afọ iri atọ ya. Gịnị dị iche n'etiti ""world wide web"" na ịntanetị? Charles Babbage malitere ihe gbasara kọmputa n'ebe mbido senchuri 19, mana a rụghị kọmputa ọbụla ruo afọ 1939 mgbe a rụrụ nke mbụ, ka e hibechara ụlọọrụ kọmputa nke mbụ. N'afọ 1960 na ụma, ụmụakwụkwọ abụọ malitere teknụzụ na-ebufe ozi site n'otu kọmputa banye ọzọ. Nke a bụ ihe a kpọrọ ""apranet"", mgbe mbụ ịntanetị na-apụta. E mepụtara apranet a ka ndị agha mba Amerịka were ya na-akpa nkata oge a na-alụ agha ""cold war"". E mere nke a ruo mgbe afọ iri abụọ ọzọ ruru, oge Tim Berners-Lee wepụtara ihe na-ejikọ kọmputa ole na ole. Etu a ka e si mụọ braụza ịntanetị na www. Ugbua, a na-eche ịntanetị dịka Google Chrome, Mozilla Firefox na Internet Explorer. Berners-Lee ka anyị ga-ekele maka ya, makana ọ bụ n'afọ 1989 ka a kpọpụtara ""braụza"" n'ime ozi atụmatụ o wepụtara. Ebe mbụ e kewapụtara n'ịntanetị bụ http://info.cern.ch/ ọ ka nọkwa ruo ugbua. Ihe gbasara #Web30 Sir Tim Berners-Lee spoke the BBC's Rory Cellan-Jones Early websites Ụlọọrụ ndị dịka Amazon na Craigslist gara na soshal midia igosipụta websaịt mbụ ha. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-43190130,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43190130,"Ihe a gbatara na Premier League: Man Utd meriri, Chelsea dara",Manchester United agaghịchala n'ọkwa nke abụọ na Premier League site na mmeri ha meriri Chelsea n'Old Trafford.,"Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United ugbua arụọla dịka onye nchịkọta otu Chelsea ugboro abụọ dị icheiche Lukaku na Jesse Lingard nyere goolu abụọ Man Utd ji merie n'agbanyeghị na Willian bụ onye Chelsea bu ụzọ nye otu goolu. Agụfuru otu goolu nke onye Chelsea bụ Alvaro Morata nyere, maka na-ọkwụghị ebe ọ kwesịrị ịkwụ oge ọ metụrụ bọọlụ ahụ. Mmeri e meriri Chelsea pụtara na ha ga-anọ n'ọkwa nke ise, nke nwere ike ime ka ha hapụ isonye n'asọmpi Champions League nke afọ ọzọ a ga-agba, maka na Tottenham nọbu n'ọkwa ise meriri ndị nke ha. Ọ pụtara na ọ bụ nanị otu mmeri ka ha nwetarala n'ime asọmpi anọ ikpeazụ ha gbarala na Premier League. Mauricio Pochettino bụ onye nchịkọta ndị Tottenham emeriela ugboro asatọ ya na ndị Crystal Palace sọrọ mpi Premier League Ndị Tottenham agbagoola ọkwa nke anọ ka ha merichara ndị Crystal Palace nọ n'ọkwa 17. Mmeri ha meriri Crystal Palace dọtịrị oge ha sọrọmpi a na-emeribeghị ha ruo 15 n'asọmpi n'ile ha na-agba. Tottenham nke Mauricio Pochettino na-achịkọta bụ otu egwuregwu a na-emeribeghị na Premier League kamgbe 2018, n'agbanyeghị na mmeri nke taa bụ nke atọ ha na-enweta n'ime iri ha na-agbaghị na be ha." afirika-48689364,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689364,UK advises Citizens: 'Unu agakwala na steeti 21 ndị a na Naịjirịa',Steeti ruru iri abụọ na otu na Naịjirịa ka ụlọọrụ 'Common Wealth' nke mba UK gwara ndị be ha bụ agaga maka enweghị ezi nchekwa ebe ndị ahụ.,"Sajid Javid bụ nnukwu odeakwụkwọ na-ahụ maka ihe gbasara ndị mbịara mbiara Ụlọọrụ ahụ depụtara ozi ahụ n'elu webụsiati ha ma kwụkwa na arụrụala ndị oyiegwu agbalitela n'ugwu Hausa Naịjirịa, ekperima na ọdịda anyanwu, nakwa ikpaike na Naija Delta. State ndị ha gụnyere bụ agaaga ugbua bụ: N'ime ndụmọdụ a, ha gwakwara ndị mba UK nọ Naịjirịa ha agala ebe ndị mmadụ gbakọjuru, ọgbakọ ebe a na-ekpe ekpere , ụlọ ahịa, ụlọ oriri na nkwari, ebe a na-agba ụgbọala nakwa ogige ebe ndị na-agba ọsọ ndụ bi. Ha kwuru na oke ntọ na-eme na steeti ndị ahụ na-abụkarị maka ego maọbụ ndọrọndọrọ ọchịchị. N'ọnụ ha, ""ị ga-ebe ndị a bụ agaaga ,gba mbọ hụ na ị kpọ ndị nchekwa zuruoke."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46989322,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46989322,Ndị meriri ntuliaka 2019 a dị mkpa?,Ntulika ndị a na-eme na Naịjirịa na-abụ bụ site n'ụdị mmadụ onye bụ karịa ihe ndị dị mkpa metụtara ndị mmadụ.,"N'agbanyeghi na ọtụtụ ndị mmadụ sonyerela n'ọsọ ịzọ ọkwa onyeisiala nke 2019, ọ ga-abụ otu ihe ahụ? Chris Ewokor, onye ọrụ BBC gara n'okporoụzọ ịme nchopụta gbasara okwu ị maata ma onye meriri a dị ndị mmadụ mkpa? Ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị mmadụ kwụnyere Muhammadu Buhari na Atiku ebe ndị ọzọ kwadoro ndị ọgbara ọhụrụ dịka Kingsley Moghalu nakwa Fela Durotoye. Ụfọdụ ụmụ nwaanyị kwụsị ike n'azụ Oby Ezekwesili na-ekwu na ọ bụ onye tozuru ime ihe dị na Naịjirịa. 2019 Elections: ""Buru anyị n'uche"" - Ndị ntorobia Kemi Diego-Okenyodo kwuru na ọ dị mma ka onye ọhụrụ arụbeghi ya bụ ọrụ mbụ zọta ya n'afọ a. Otive Igbuzor kwuru na n'agbanyeghi na ihe jisike agbanwe, na ntuliaka a ga-abụ njịkọ ihe metụtara mmadụ nakwa ụdị mmadụ onye bụ. Onye ọzọ a jụrụ bụ Ernest Ereke kwuru na ezigbo ọrụ dịrị onye ọbụla ga-emeri ntuliaka a n'ihi na ihe niile site na nchekwa, akaụnaụba obodo, ọrụ, njịkọ obodo nakwa nwulite obodo adịghị n'ọnọdụ dị mma." afirika-54076393,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54076393,"Ị tọkịrị n'ime nwaanyị, nọrọ jụụ ma mee ihe ndị a","Ọtụtụ chere na mgbe amụ nwoke tọrọ n'ime ọtụ nwaanyị, ọ na-abụ na ha na-ezu mmekọrịta ha n'ohi.","Ntọkịrị amụ n'ime ọtụ nma-emekarị mgbe mmekọrịta nwoke na nwaanyị sọgburu onwe ya Mana amụ nwoke ịtọ n'ime ikpu nwaanyị, ihe Beke kpọrọ 'penis captivus', abụghị ihe na-eme kwa mgbe. Amụ ịtọ n'ọtụ na-emekarị mgbe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta. Oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-asị na ọ bụ mmemina onye gbara n'ezi, ya bụ onye gara dina onye na-abụghị nwunye ha maọbụ di ha. Ihe onyoonyo wuruewu n'izu gara aga gosiri etu otu nwoke si tọkịrị n'ime nwaanyị ebe ha na-enwe mmekọrịta. Ndị mmadụ wee si na ọ bụ ọgwụ di nwaanyị ahụ mere jidere ha, ụfọdụ na-asị na ọ bụ n'ihi na ha na-ezuru ezuru eme ya. Gịnị na-ebute 'Penis Captivus'? Ndị Yotoba na-akpọ ya 'magun'. Ihe ndị Yoroba kwenyere maka Magun Dkt. Francis Ezenwankwo ọnụ na-eru n'okwu n'ahụike ụmụnwaanyị sị na o kwenyeghi na ọgwụ maọbụ nnsị a, maka na ọ bụ dọkịnta. Ọ sịkwa na ntọkịrị a abụghị ihe na-eme kwamgbe. Mana dịka ndị dọkinta si kwuo, ọ sị ""ihe na-ebute ntọkịrị amụ n'ime ọtụ - 'penis captivus' - bụ mgbe anụ ọtụ nwaanyị na-akpadosie amụ nwoke ike nke ga-eme na amụ nwoke ahụ agaghị enweike rituo na ọtụ nwaanyị ahụ."" ""Nwoke na nwaanyị ga-atọ na mmekọrịta ha. Mana ọ bụghị oge ọbụla ka ọ na-eme."" Ọ sị na ọ hụbeghi ihe dị etu a kamgbe o bidoro rụwa ọrụ dịka dọkịnta. Mana Dkt Ezenwankwo bụ Obs na Gynae na-agwọ ụmụnwaanyị sị na o nweghi ihe gbasara 'penis captivus' na ịta mmadụ amusu, iji ọgwụ jide mmadụ, maọbụ 'ihe onye chọ ka ọfụ n'ịgba n'ezi'. Ọ sịkwa na o nweghi ihe na-ebute ya ha ma. Dkt Ezenwankwo sị na o kwenyeghi n'ịgwọ ọgwụ. 'Penis Captivus' o nwere ọgwụgwọ? Gịnị na-ebute 'Penis Captivus'? Ebe ọtụtụ dọkinta na-asị na ha ejibeghị anya ha hụ ebe o mere mmadụ mbụ, otu nwaanyị kwuru na o meela ya mgbe ya na di ya na-enwe mmekọrịta. Ọ sị na ọ bụ mgbe o ruru oge aramara ahụ tọbara ya ụmị. N'ọnụ nwaanyị a, ""ọ bụ etu ọtụ m sị nabata oke ụtọ aramara"". Gịnị ka i ga-eme ma ị tọkịrị n'ime nwaanyị? Ihe mbụ ndị nwere 'penis captivus' kwesịrị ime bụ Ihe ndị a ka Dkt Ezenwankwo na-agwa onye ga-ahụ onye ya n'ọnọdụ a. Mana Dkt John Dean, bụ dọkịnta kajara akaja n'ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị na mba UK, kwuru si, ""ọtụtụ ndị na-abịa ọgwụgwọ agwala ya maka ahumihe ha n'ịtọ n'ime ọtụ nwaanyị"". Ọ sị na o nwere ndịiche dị n'etiti 'penis captivitus' na nke na-emekarị ụmụnwaanyị ana-akpọ 'vaginismus'. Gịnị bụ 'Vaginismus'? Dkt sị na ọ bụ nwaanyị achọghị mmekọrịta, ọtụ ya ga-akpuchi onwe ya. A ga-enye nwaanyị ahụ 'dilators' ga-enyekwa ya aka imepe ọtụ ya. Dkt Dean sị 'vaginismus' na-eme mgbe ọtụ nwaanyị kpachiri onwe ha (tupu amụ nwoke abata), nke agaghị ekwe ka o nwee mmekọrịta ọbụla. Otu onye kpọrọ onwe ya Paul gwara BBC na o mere ya sị, ""Anụtụla m akụkọ a mgbe m dị 14 maọbụ 15 maka otu nwoke tọkịrị n'ime nwaanyị. Ọ sị na ha mechara kpọọ ndị ọrụ gbatagbata, ha wee nyere ha aka. Paul sị na o mechara hụ nwaanyị ọ hụrụ na-anyana mba Japan, ha wee na-enwe mmekọrịta. N'otu ụbọchị, o wee tọkịrị n'ime nwaanyị a ka ha na-enwe mmekọrịta. ""Ihe niile wee kwụsị ka m tọrọ n'ime nwaanyị a, anyị wee sị na ọ ka mma ka anyị kwụsị, mana ha enweghike ịpụta ka ha nwara ugboro atọ."" ""Anyị wee mụwa amụ, n'ihi na ọfụghị anyị ụfụ."" Ka Paul si wee cheta, ugbua, Paul dị afọ iri asaa na ise (afọ 75)." afirika-56454311,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56454311,Sunday Igboho: Ihe ndị Yoroba na-ekwu maka atumatụ nwereonwe,"Sunday Adeyemo ejikwanu Sunday Igboho mara ekwuola na o nweghikwa okwu dị na ịga n'ihu na otu Naịjirịa ebe udo kọrọ ka ọkọchị n'ala Yoroba, gbanye na otu ogbugbo ha nwere bụ inweta obodo Yoroba kwụrụ onwe ya.","Igboho kpuhere nke a n'ụbọchi Wednesday mgbe o nwere mkparịtaụka n'etiti ndị ntakụkọ, kpọkuru ndị ntoroọbia ala Yoroba nille ikwado ọkammụta Banji Akintinye n'atụmatụ ya inweta obodo yoruba kwụrụ onwe ya n'ọnọdụ mba Oduduwa. N'okwu ya,''Oke ruoro anyị ka anyị na-achọ, ndị ntorobia Yoroba niile nọ n'ala a, ga-adọnyeriri Baba Akintonye ukwu.'' Ọ sịkwa; ""Mụọ onwe m bụ Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara ga akwado nna anyị, nkea bụ onye doro anyị anya na achọ maka oke ruoro anyị. Anyi na arịọ amara chineke maka ogologo ndụ na arụ isiike n'isi ya. Enweghi udo, nchekwa adighịkwa.'' Anyị achọghi ndi Fulani na-achị ehi Adeyemo sị: ""Bido taa gawa anyị achọghị ndị Fulani na-achị ehi n'ala anyị ila akụkụ ubi anyị n'iyi, anyị echere ha aka mgba ma laa ha niyi. ''Ọ bụrụ na ndị uweoji wakpoo anyị n'ihi ya, anyị ekeelere ha nkwụcha, kpụọ isi chere mkpọrọ, anyị achọkwaghị Nigeria ọzọ, kama mba yoruba . onweghi ihe di na otu nigeria ebe imirikitimi akụrụngwa eji enyere ndụ aka na ala nigeria nọcha na aka ndi mpagara ugwu''. Kedụ etu ndị Yoroba si nabata atụmatụ a? Ụfọdụ ụmụ amala Yoroba e tinyela ọnụ n'okwu a n'eko achịcha maka ọkpụkpọ oku Sunday Idogho na akpọ ka enye yoruba mba nke aka ya; Dọkịnta Yemi Farounbi - bụ a na-akwanyere ugwu n'ala Yoroba ma bụrụ kwa onye nọchiteburu anya ala Nigeria na mba Phillipines - n'itinye ọnụ na ya bụ okwu, kpuhere na ọ bụ eziokwu na ụmụ ala Yoroba na-akwa arịrị maka enweghi ezinchekwa. Ọ sị; ''ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ndị kwesiri ichekwa ha gbakụtara ha azụ.'' O rutukwuruaka na agbanyeghi na otu jikọrọ ụmụaamala yoruba Afanifere na-eti mkpu ka ahazigharia ala Nigeria, ihe ndị a niile kwesiri ka elebe ya anya. Ọ gara n'ihu kwuo na nnwere onwe Sunday Idogho na akpọ ọkpụkpọoku ya kwesiri ịbụ nkwado ụmụanala Yoroba na abụghi nke otu onye. Bar Stephen Ajibola James n'itinye ya ọnụ site na ngalaba ikpe, katọrọ agwa Sunday Idogho na ndi ọzọ dika Nnamdi Kanu na Asari Dokubo na-azọ ka enweha mba nke aka haa. Ọ hụtara ya dika nke dara iwu n'ihi na okwesiri inwe nkwado ndị omeiwu bụ ndị okwuru ga-esoro ụkpurụ ime ka obodo bụrụ mba kwụrụ onwe ya. Ọzọkwa o kwuru bụ Gbanye na inye mba ikekiere bụ ihe iwu kwadoro kama na ekwesiri isoro ụkpụrụ dị ma. Gbasara ihe gọọmenti n'onwe ya kwesiri ime na ọkpụkpo oku inwe mba Yoroba kwụrụ onwe ya, Ajibola kwuru na ọnaghi akwado ka gọọmenti nwuchie ọbụla maka ihe iko obi n'elu kama leghara ya anya nihi na ya bụ okwu achịtaghị aja ọbụla. Cheta na dika Sunday Adeyemo na-ekwu okwu Oduduwa maobu Yoroba Republic, NNamdi Kanu, Asari Dokubo, Ralph Uwazurike na ọtụtu ndị ọzọ na-achọkwa atụmatu nwere onwe nke ha. Mana, agbanyeghi ihe ha na-eme, iwu Naịjiria akwadoghi nkewa mba ahụ." media-44595520,https://www.bbc.com/igbo/media-44595520,Gọọmentị Plateau etiela iwu ọnọdụ gbata gbata,Mmadụ ruru iri na otu anwụọla na Plateau steeti n'ime ọgwụ pụtara n'etiti ndị ọrụugbo na ndị na-achị ehi n'ime obodo Gashish na Ropp na steeti ahụ.,"Agbara ụfọdụ ụlọ ọkụ dịka esi gba ụlọụka ọkụ n'afọ 2015 na mpaghara ahụ Akukọ kwukwara na gọọmentị etiela iwu ọnọdụ gbata gbata nke akpọrọ 'State of emergency' na bekee n'obodo Riyom, Barkin Ladi na Jos saut maka mkpa mkpa a na-eme ugbua na steeti ahụ. Ọ bụ ndị uweojii na-agụpụta ọnụ ọgụụ ndị nwụrụ, mana anya hụrụ mkpa mkpa a mere na-ekwu na ndị nwuru karị nke a. Akụkọ na-ekwu na o nwere ndị agha nwụrụ na mkpa mkpa a, mana ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Anthony Atolagbe kwuru na ọ bụ asị. N'ime akwụkwọ ozị onye ode akwụkwọ gọọmentị Plateau state bụ Rufus Bature zipuru ndị ntaakụkọ, o kwuru na iwu ọnọdụ gbata gbata bụ maka ị kwụsị ogbu gbu mmadụ ma-eme. Ugbua o nweghị ndị uweojii nwuchiri maka ogbugbu a mere taa. Akụkọ ga-amasị gị:" media-44367113,https://www.bbc.com/igbo/media-44367113,Lee ihe ise nwere ike ịnọchi plastik na be gị,"Taa bụ ụbọchị ncheta gburugburu obibi nke mba ụwa, nke a kpọrọ 'World Environment Day' na bekee.","Na Maachị 2017 gọọmentị Lagos steetị machịrị ebe a na-ekpofu ahịhịa olusosun maka awụrụ na-apụta na ebe a Ị ma na ndị uweojii ga-anwụchị gị ma tụba gị na mkpọrọ kpamkpam ma ọ bụrụ na i jiri nailọn(nylon) n'aka na Nairobi,isiobodo Kenya? Ị makwa na gọọmentị ga-ada gị nha ma ọ bụrụ na i ijiri nailọn bata n'ala Rwanda? Kedu maka gị onwe gị? I chere na ị ga-anọnwụ otu ụbọchị na-ejighị plastik mee ihe ọbụla? Ajụjụ ndị a dị ezigbo mkpa n'ihi na plastik na-ebute nnukwu nsogbu na gburugburu obibi na mba ụwa niile. Plastik na-afachi ọwa mmiri sị aga ma na-ebute nnukwu ọrịa ma ọ bụrụ na ọ ba gị n'ahụ. Ị ma na chingum (Chewing gum) were rubber n'ime ya, ihe a sokwa n'ihe ejiri eme plastik. Ihe bụ nsogbu dị n'uwa niile Dọkịnta Ikechukwu Mgbolu gwara BBC Igbo na-agbanyeghị n'ọrịa dị na Naịjirịa abụghị maka plastik banyere n'ime ahụ mmadụ, ọ dị ezigbo mkpa ịkwụsi ike n'ọrịa dịka iba (malaria) na afọ ọsịsa (cholera) ka nkụ na Naịjirịa maka na plastik fachiri ebe mmiri si aga, ma ọ bụ na-emebi mmịrị ndị mmadụ na-aṅụ n'ime obodo dị iche iche. Cheta kwa ihe na-eme na mpaghara Naija-Delta, bụbụ ebe ọ kachasị njọ bụ nsogbu mmebi gburugburu obibi. Gịnị bụ ihe ndị ọzọ were ike ịnọchi plastik? N'ime akụkọ a, anyị ga kọwara gị ihe ndị ọzọ ị nwere ike iji nọchie anya plastik. Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-49934803,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-49934803,Xenophobia: Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - Buhari,"Ka njem Onyeisiala Muhammadu Buhari na mba Saụt Afrịka banyere abalị nke abụọ, o zutela ndị Naịjirịa bi na mba ahụ.","Buhari gwara ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka ka ha na-erube isi ma na-ezere ihe ọ bụla ga-ebute akpọmasị n'ihi na ọbụ ihe ha mere ka a ga-eji kpee ha ikpe. End of Twitter post, 1 Buhari sịkwa ha buru n'obi na ha bụ ndị nnọchịte anya Naịjirịa n'ebe ọbụla ha nọ. O tinyekwara ọnụ na mwakpo a na-awakpo ndị Naịjirịa na ndị mba Afrịka ndi ọzọ na Saụt Afrịka. Emere nzukọ a Buhari na ụmụ Naịjirịa nwere na mkpuchi. Ekweghi ndi ntaakụkọ BBC na ndị ọzọ banye ebe nzukọ a na-eme. Nke a nwereike ịbụ maka ọgbaaghara ndị otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) mere ụnyaahụ. Ndị Ipob ruru iri atọ gara na ụlọ Union Building na-asị ka Buhari pụta bịa zute ha. Ndị uweojii mechara jiri mgbo egbe rọba chụsasịa ha. Mgbọ tụrụ mmadụ ụfọdụ n'ime ha ma merụo ha ahụ. Onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu mechara gbasa ozi maka ihe ahụ mere. Kanu katọrọ ihe ndị uweojii Saụt Afrịka mere ma kwuo na ha ga-enyocha ya bụ ihe iji mara ebe ha kwụ. Buhari na onwe ya si na obi di ya ụtọ etu Saụt Afrịka si nabata ya ma kwuo na ha agwala Onyeisiala Cyril Ramaphosa ka ọ bịa ka Naịjirịa lee ya ọbịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 43797316,https://www.bbc.com/igbo/43797316,Ụlọakụ mbaụwa agaghi ebinye steeti ọzọ ego -El-Rufai,"Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai ekwuola na ndị ụlọakụ nke mbaụwa nke a na-akpọ ""World Bank"" na Bekee agaghị ebinye steetị ọbụla na Naịjirịa ego ha chọrọ ibite ma nke Kaduna Steeti esoghị ya.","Nasir el-Rufai rụbụrụ ọrụ ka Minista ha ahụ maka Abuja Kaduna Steeti so na steeti ndị rịọrọ World Bank arịrịọ ka ha binye ha ego ha ga eji rụọ ọrụ mmepe obodo, mana ụlọikpe ukwu kagbụrụ nke Kaduna ma gaa n'ihu kweta ka nke ndị ọzọ ga n'ihu. Ka Nasir el-Rufai na emepe nzụkọ ndị ọkaipe na Steetị ya, bụ nke mere na Barnawa, bu obodo dị na isi obodo steeti ahụ, o kwuru na ọ bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka e jiri kagbuo ego ụlọakụ mbaụwa chọrọ ibinye steeti ya. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ Kaduna kachasịri tozuo n'usoro eji enye ego n'ụlọakụ mbaụwa. ""Ndị ụlọakụ mbaụwa agaghị ebụnye steeti ọbụla ego ma ya bụrụ na Kaduna esoghị... ndị ụlọakụ mbaụwa nwere iwu ji ha. Kedụ etu anyị ga-esi gbachie ego steeti tozuru ma sị ka nke ndị ọzọ ga n'ihu? Ọ bụ nsogbu a di n'ihu ụlọakụ mbaụwa,"" El-Rufai kwuru. BBC Igbo ezigala ụlọakụ mbaụwa ozi ka anyị nụ n'ọnụ ha mana ha asabeghi anyị ruo mgbe anyi dere akụkọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50450802,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50450802,Fasting: Ibu ọnụ ruo abalị 40 ọ na-egbu mmadụ?,Ibu ọnụ na-abụkarị atụmaatụ ndị okpukpere dị iche iche ji akwado ekpere ha.,"Ụfọdụ na-ebu ọnụ otu ọnwa maọbụ karịa Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na o nwere ụdịrị ibu ọnụ ga-abụ mmadụ mee, o butere onwe ya nsogbu. Ụkọchụkwụ Paul Chikwem bụ onyeisi n'ụlọụka Christian Pencticostal Church dị na Festac kwuru na ibu ọnụ dị mma maka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraist. O kwuru na ibu ọnụ dị n'ụdị n'ụdị dịka nke gụnyere isi n'ụtụtụ ruo na mgbede, iṅụ sọ mmiri , iri sọ ụfọdụ nri nakwa etu ọbụla onye na-achị ya si kpata. Mana ọ dụrụ ọdụ sị na ibu ọnụ karịghala nke a ga-ebi ụbọchị ahụ maọbụ gụnye erighị aṅụghị ma ncha ruo ihe gafere ụbọchị iri abụọ na otu, e kwesiri ịkwadoro ya ọfụma site n'ime ihe ndị a. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị: Osita Amakaeze: Ndị ntorobia chọrọ ndị ndu ga-ezi ha ụzọ ọma" afirika-43011996,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43011996,Ecowas kwetere itinye ụtụisi na ngwaahia a na-eme n'ụlọ,Gọọmenti etiti Naijiria ekwuola na ha ga ewechita ụtụisi ngwaaghị emere na Nigeria dịka ọtọbiribiri mkpụru osisi bekee kpọrọ fruit juice nakwa recharge card.,"Kemi Adeosun bụ onyeisi kọmiti tariff technical committee (TTC) bụ ndị tụpụtara alo a Nke a pụtara n'ọnụahia ndị a ga arielu mgbe adịghị anya. Minista okwu ego dị na-aka bụ Kemi Adeosun kwuputara nke a dịka otu n'ime ihe ha kpebiri na ọgbakọ tariff technical committee nke ụlọakụ ukwu bụ Central Bank, ministry nke ugbo nakwa ọrụaka, Federal Inland Revenue Services, ụlọọrụ odeakwụkwọ nke gọment nakwa Manufacturers Association of Nigeria so n'ime ya. Adeosun kwuru na nke a ga-enyere azụmahia na mba Ecowas aka. Mana ụfọdụ na-eche na ya bụ alo ga-ebuli ọnụahia e mere na Nigeria, dịka nta akụkọ siri bụ o. Nkedụ ngwaahia ihe a metụtara? Ihe ndị so na ngwa ahịa ndị a: pefium,ude, mmanya anaghị egbuegbu, mmanya ọtọbiribiri mkpụrụosisi, ncha, ncha ntụ e ji asụakwa, rịchajị kadị na akwụkwọ firifiri e ji aga mposi. Adeosu si na nri dịka nụdles na spageti esoghị na ya maka ha bụ nrị ndị mmadụ na-erikebe. Gọọmenti wepuru ụtụisi na nri kemgbe afọ 2009 ka e were nyere ndị na-arụpụta ngwaahia na Nigeria aka irepụ ngwaahia ha." afirika-48149212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48149212,Nkalagu Ebonyi: Gịnị mere o ji ewu taa,"Ozi na-eru anyị ntị n'ụtụtụ a bụ na-akwagala Yomi Shungle Nkalagu, Ebonyi steeti.","Yomi Shogunle bụzị Area Commander na Nkalagu Eji okwu na agba agba na ntị mara ya bụ onye uweojii nke ọkwa ya bụ Assistant Commissioner of Police na Bekee, dịka Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị kwuo. ""Ugbua Shogunle ga-abụzị Area Commander na Nkalagụ bụ ebe esi Abụja ọnọbụ zịga ya"", Mba gwara BBC taa. Ọtụtụ mmadụ na-aṅụrị ma na-ekwu ọtụtụ ihe gbasara nzipu a ezipuru Shogunle. End of Twitter post, 1 Gịnị butere okwu ndị a? Nwaamadị a ekwuola ọkpụrụ okwụ gbakara ndị mmadụ ntị na mbụ. Cheta na ọ bụ ya kwuru okwu mgbe ndị uweojii jidere ụmụnwaanyị dị otu narị n'Abuja bụ ndị ha sị na ha bụ ndị ji ahụ ha achụ ego. Lee ihe o kwuru mgbe ahụ: Okwu a hiri odo na intanet niile bụ ebe ndị mmadụ katọrọ ya. Joe Abah bụ onye ama ama na Twitter jijere ya na-ụdị a: Ihe ọzọ ejiri mara Shogunle bụ ịkpọchi akara Twitter ndị okwenyeghị n'okwu ha. Ọ bụkwa n'akara Twitter ka ọ nọ nyụọ ahụrụ mgbe ọ sị ka ndị mmadụ ghara ịsụrụ ndị uweojii Bekee ma ejide ha, kama ha sụwara ha Bekeenkebi ma ha chọọ ka udo chia. Ihe ndị a mere nzipu a ezipuru nwaamadị a ji ewuewu. Kedụ ihe chebiri ndị Nkalagu na ọbịbịa odokwu nwoke a? Lee ihe ndị mamdụ kwuru. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51602835,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51602835,Wilder vs Fury: Tyson Fury akụpụla Deontay Wilder kpakpando n'anya,Tyson Fury abụrụla Eze dịka o meriri Deontay Wilder n'ọkpọ asọmpị WBC.,Ọ bụ n'agba nke asaa ka ndị otu Deontay Wilder weliri aka elu tupu asọmpi a abụru akwamozu. Tyson Fury enyeghị Deontay Wilder efe imeharị ahụ. Gịnị ka mmeri a pụtara? I chetara na ọ bụ n'afọ 2015 ka Fury metụrụ mmerị dị etu a aka. Akukọ kwuru mgbe ahụ na ihe kpatara Deontay ji anyụ ya anya kamgbe afọ ise ndị a bụ maka ahụ ibu ya nakwa ihe ndị ọzọ. Mana ọ dịka Fury riri amosu eji atahụ were pụtazịa n'afọ 2020 wee mewa Deontay obi site n'ikụfụ kpakpando n'anya n'agba ugboro ugboro nke asọmpị a. Nke a mere ka ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuo na ọ bụ okwu ka Fury ji mmeri a kwuo. Ihe na-ekwu n'elu soshal midia Nke mbụ sị n'akara twitter nna ukwu @LennoxLewis kelere Fury ma gwa Wilder ka ọ mụrụ akọ site na mmeri a. @nielo_2wit kwuru na ọ bụ etu a ka ụwa dị. Mana @RyanCFowler nwere ozioma pụrụiche nye Deontay Wilder. @luckiest2020 weputara ozi Wilder na Fury zigara onwe ha ma kwuo na ọ dịghị mma ka mmadụ kparịa Chukwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-48167225,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48167225,"Ọ bụrụ m bụ onyeisiala, a kara m iritu n'ọkwa - Onaiyekan",Archibishop ụlọụka Katọlịk dị n'Abuja kwuru nke a ma gbarụọ ihu kwuo na ndị ọchịchị emeela ka Naịjirịa bụrụ mba ndị mmadụ achọghị ịnọzi na ya,"O kwukwara na nke a kpatara na ụmụ ntorobia na-agbaga mba Yurop n'ụzọ ezighi ezi. Onye ga-azọpụta otu Man U? Ka ọ dị ugbua, Manchester United enweghi ebe ha ji azụ aga gbasara ibanye n'ogogo ndị nọ n'ọkwa otu ruo anọ na tebulu Premier League. Huddersfield gbara mbọ hụ na ha tinyere Man Utd n'ọnọdụ ""gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma"". Scott McTominay nke Man Utd bu ụzọ kpaa ike ka o nyere goolu na nkeji asatọ e ji malite asọmpi a. Mana Isaac Mbenza nke Huddersfield gbajiri nku ha ji na-efe ka ọ gbanyere goolu ha ji saa ya na nkeji 60 nke ọkara nke abụọ. Ntu a Huddersfield kpọrọ ha pụtara Man Utd agaghị eso ndị ga-agba na Champions League nke afọ na-abịa. Gịnị na-esere Umahi, Nwodo na IPOB? Otu IPOB akatọọla aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi nakwa onyeisi Ohaneze Ndị Igbo bụ Ogbonnia Nwodo. Ha mere nke a dịka Nwodo na Umahi gọrọ aka na ụkwụ ha n'iwu Ipob nyere sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Peter Obi na okwu ya gbasara ọdịnịhu Naịjirịa Onye zọrọ oche osote onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Peter Obi ekwuputela ụjọ ya gbasara ọdịnịhụ Naịjirịa. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasa ozi Sun nke Naịjirịa nwere, Obi tụtara alọ etu NaịJirịa ga-esi gbanahụ nsogbu enweghị ọrụ ,iji ụgwọ nakwa ime ka ego ana-amapụta maka nchekwa obodo ghara ịla niyi. Egwu chị ọkụ asọmpị Premier League taa Manchester united na Huddersfield ga-achịpụ ya taa n'elekere abụọ nke ehihie Asọmpị Premier League ka chi ọkụ dịka otu egwuregwu Chelsea nakwa Watford ga-achịpụ ya n'ụbọchị may 5 bụ taa n'ọgbọ egwuregwu Stamford bridge. Huddersfield na man utd ga-ama aka n'elekere abụọ nke ehihie n'ọdọ egwuregwu John Smith ebe Arsenal na Brighton ga-ma onye ike ga-agwụ n'elekere anọ na ọkara. Ebubo ndị agha Naịjirịa gbasara May 29 Ụfọdụ pati ndọrọndọrọ ọchịchị ha na nke na-achị Naịjiria na-ama aka akatọla etu ndị agha Naịjirịa si pụta kwuo, na ụfọdụ mmadụ na ndị mba ofesi na-agba mbọ ịhụ na ha ghasasiri mmemme may 29 ga-edubanye onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị nke ugboro abụọ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha naịjirịa bụ Sagir Musa boro pati ndị a ebubo a, ma kwukwa na ndị mba ofesi chọrọ ibute ọgbaghara n'etiti otu dịka 'Multinational Joint Task Force' na-agbaso ndị omekome dịka Boko Haram mgba. N'ofesi Ogbunigwe Israel gburu nne na nwa Ndị agha gaza atụpụla ogbunigwe ruru narị abụọ na mba Israel dịka ndị agha Israel si kwuo. Nke a butere ntụghachi ogbunigwe na ogige Palestine. Mgbọ israel ji zaghachi ndị Palestine gburu mmadụ anọ gụnyere nne na nwa dịka ụlọrụ dị na gaza si kwuo. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Coal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha" afirika-52664651,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52664651,SC Genotype - Gịnị ka ọ bụ?,Soshal midia enwurula ọkụ maka etu ndị mmadụ si ekwu na Olamimlekan eji Laycon mara bu genotype SC.,"Nke a mere ka ndị mmadụ jụwa maka ihe SC pụtara. Dọkịta ahụike bụ Chidi Akaghara kwuru na ọ bụ udiri genotype na-anaghị ada ụda ka genotype ndị ọzọ dịka AA, AS nakwa SS. O kwukwara na adaghị ụda ya mere ka ndị mmadụ ghara ị na-eme nchọpụta maka ya kamgbe. Mana dọkịta Mcginger Ibeneme kwuru na SC bụ udiri sickle cell ọzọ enwere, inwereike ịkpọ nwanne ""sickle cell."" O kwuru na onye bu SC genotype na-esi n'aka otu ndị mụrụ ya nweta S ma nweta C n'aka onye ọzọ . Njirimara ya yitekwara nke SS makana onye ahụ ga na-aya ahụ mgbe ọbụla. O kwukwara na anaghị ahụkarị udiri genotype a na Naịjirịa kama a na-ahụkarị ya n'etiti ndị si mba Carribean. Dọkịta Ibeneme kwuru na iron na-akọkarị n'ahụ onye bu SC nke mere na a ga-agbado anya na-achịkwalata ahụike onye ahụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: Ihe ise mere ndị 'NGO' jiri gbajọọ iwu 'sickle cell bill' Sam Egwu wepụtara A gụrụ akwụkwọ iwu maka mgbochi ọrịa okponọbara nke Bekee kpọrọ 'sickle cell' agba nke abụọ ya n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Tuzde. Mana ọtụtụ otu abụghị nke gọọmenti na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa 'Sickle cell' gbajọrọ iwu ahụ nke Sam Egwu bụ Sinetọ na-anọchite Ebonyi-North n'Ụlọomeiwu Ukwu wepụtara. Sickle Cell Eradication Law: Ọ ga-ebute ịkpa oke megide ndị na-arịa ọrịa ọwọ - Ọkaiwu Eze Ha kwuru na ndị haziri ya bụ akwụkwọ iwu akpọghị ndị ya bụ okwu ahụ metụtara (stakeholders) oku ka ha tụnye alo ga-eme ka iwu ahụ mịta ezi mkpụrụ. Ha rụtụkwara aka na okwu igbochi ụfọdụ mmadụ ịlụ onwe ha n'ihi ụdị ọbara ha nwere megidere ikike dịrị onye dị n'iwu Naijiria. Sinetọ Sam Egwu bụbu Gọvanọ Ebonyị steeti Akwụkwọ iwu 'Sickle cell' Sam Egwu wepụtara n'ụlọomeiwu Naijiria chọrọ ka a enwee iwu nke ga-eme ọtụtụ ihe maka ọrịa okponọbara gụnyere : Mana ndị otu abụghị nke gọọmenti kwuru na ya bụ akwụkwọ iwu adabachaghị n'ihi ụdị asụsụ e jiri dee ya, na ihe ndị kwesịrị ka etinye adịghị na ya nakwa ihe dị na ya ekwesịghị ịdị ya. Lee ebe ụfọdụ ha kwuru iwu ahụ si eri mperi: 1. Ịkpụ mmadụ isi mgbe ọ nọghị ya Onye nchikọta National Sickle Cell Foundation bụ Dkta Annette Akinsete sị na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe ndị mmadụ ga-anabata, na ha kwesiri ịkpọ ndị ya bụ ọrịa metutara na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ""genetic counselling"" n'olu Bekee ka ha tụnye alo na ya bụ okwu a maka na anaghị akpụ mmadụ isi n'azụ ya. Toyin Adesola, onyeisi otu 'Sickle Cell Management and Advocacy Initiative' kwadoro ihe Akinsete kwuru sị,""Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe gbasara ọrịa okponọbara, ị kpọọ ndị maa maka ya, ndị na-arụ ọrụ gbasara ya nakwa ndị ya bụ ọrịa na-enye nsogbu."" Dkta Annette Akinsete 2. Ime ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ ịlụ onye masịrị ya Dkta Annette Akinsete sị na akwụkwọ iwu ahụ chọrọ i me ka ọ bụrụ ịda iwu mmadụ iso obi ya n'ihe gbasara ịlụ onye masịrị ya. ""Nke a megidere ikike dịrị onye dịka o siri dị n'iwu Naijiria. A ma m na ọ gaghị enwe isi."" Akinsete ji mgbe ndị agha na-achị n'Oyo steeti, mgbe ha chọrọ iti ụdị iwu ahụ bụ nke ọ sị mara afọ n'ala mgbe ahụ maa atụ. Akinsete kọwara mkpa nkuzi na mgbazi maka ọrịa okponọbara dị mkpa ma sị na ụfọdụ mmadụ na-esi onwu na ha ga-anụrịrị agbanyeghị ntuziaka niile e nyere ha. ""Nchọpụta gosiri na ụfọdụ na-ekpebi na ha agaghị amụ nwa, ha gaa kuru nwa."" ""O kwesiri inye ndị dị otu a ohere ikwu ka ha ga-esi jikọrọ onwe ha."" Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation jụrụ ajụjụ sị na ọ bụrụ na e mee ya iwu na onye ọbụla ga-eme nnyocha ọbụla tupu ha alụọ, ma gbochie ndị nwere AS maọbụ SS ilụ onwe ha,""Kedụ maka ndị chee na ha nwere AA mana ndị lab edehie mpụtara ụdị ọbara ha nwere nke Bekee kpọrọ 'misdiagnosis'. 3. O kwesịrị ịbụ 'ibelata' ọ bụghị 'ikpochapụ' ọrịa okponọbara Ndị otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere ọrịa okponọbara sịrị na ọ bụrụ na ndị omeiwu chọrọ ime ihe nke ọma, na ""ọnụ okwu ha kwesiri ịna-ekwu bụ maka 'igbochi', 'ịkwado ịgbasa ozi' na 'ịgbazị ụzọ' ọ bụghị 'ikpochapụ"" ọrịa okponaọbara, maka na ọrịa ahụ enweghị mkpochapụ. ""Ị nụ mkpochapụ, kedụ ihe ị chọrọ ime? Ị ga-egbuchapụ ndị niile nwere ọrịa ahụ?"" Akinsete sị na ọ bụrụgodi na e nwere ike ikpochapụ ndị nwere ike ibute ọrịa okponaọbara site na alụmdinanwunye, kedụ maka ndị na-amụta nwa na alụbeghị di? 4.Iwu ahụ ekwughị maka nsogbu dịrị ndị nwere ọrịa sickle cell Toyin Adesola nke Sickle Cell Management and Advocacy Initiative onye tụrụ arịrị sị na 'o nweghị ndị ọrịa a metụtara a kpọrọ oku sị n'iwu ahụ ezughị oke. Adesola sị na akwụkwọ ""iwu nke a elebaghị anya n'ọnọdụ ndị nwerela ọrịa okponaọbara na nsogbu ha na-ahụ inweta nleta ahụike zuru oke na Naijiria."" Ọ gara n'ihu kọwa na iwu ahụ na-ekwu maka naanị ndị nwere AS na SS ma chezọọ na e nwere ndị enweghị ụdị ọbara mana ha nwere ike ịmụta nwa nwere ọrịa okponọbara. ""Ụfọdụ amaghị ndịiche dị na-etiti ""genotype' na 'Blood Group.'"" Adesola gara n'ihu rịọ ka ""Ụlọoemiwu kpo oku ndị na-arụ ọrụ n'ihe gbasara ọrịa okponaọbara ka a kpa maka akwụkwọ iwu ahụ."" Winifred Otokhina bụ ọkaiwu nke ụlọọrụ TonyMay Foundation 5. O nwere ndị agụpụrụ n'iwu ahụ Winifred Otokhina nke TonyMay Foundation kwuru na akwụkwọ iwu ahụ ekwụghị maka etu a ga-esi enyere ndị nwere ọrịa okponọbara aka ịnata nleta na oke luru ha dịka mmadụ. Otokhina tụrụ arịrị na ""Ndị nwere okponaoba anaghị enweta ohere inweta ọrụ dịka ndị ọzọ"" mana iwu ahụ ekwughị maka ya. Mbọ BBC gbara inweta ọsịsa Sam Egwu amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwenti. Akụkọ ndị ga-amasị:" 42821144,https://www.bbc.com/igbo/42821144,Ọria yelo fiva na Naijiria: Ihe ị kwesiri ị ma maka ọgwụ mgbochi,"Taa bụ nkwọ, ụbọchị ịrị abụọ na ise na onwa Jenụwarị, Gọọmentị Naijiria bido inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ọrịa yelo fiva.","Aedes albopictus bụ anwụnta na-ebute ọrịa yelo fiva Otu na-ahụ maka ahụike na uwa niile gba gburugburu bụ World Health Organistion na bekee ga-eso kwa na nyemaka mmega ahụ nke a. Mana cheta na oge gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ bị n'ugwu Naijiria na-atụ egwu ịgba ọgwụ mgbochi maka akụkọ asịrị na-ekwu na ọ na-ebuta amụtaghị nwa. Na Februwari na afọ 2013, agbagburu ndị ọrụ ahụike na-enyeọgwụ mgbochi ọrịa polio itoolu na Kano Steeti. Gịnị bụ ihe pụrịche na mgbasa okwu a? Ugbua, ọ dịzịka echiche ahụ na-echeharị. Otu dọkịta bụ Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ọtụtụ mmadụ na-apụta mgbe niile a na-agba ọgwụ mgbochi. Gọọmentị chọ ka ọgwụ mgbochi a metụta mmadụ nde abụọ n´ise Mgbolu kwuru na ""kemgbe meningitis na lasa fiva pụtagharịrị, ọtụtụ ndị mmadụ na-apụta ịgba ọgwụ mgbochi"". ""Ugbua ndị na-achị obodo na ndị otu di ichiche na-enye aka igbasa ozi a,"" Mgbolu kwuru. Onye n'onye ka a ga-agba ọgwụ mgbochi? Gọọmentị Naijiria ekwuola na ọbụ mmadụ nde abụọ na ise ka ha ga-enye ọgwụ mgbochi nke a. Na afọ 2026 gọọmentị chọrọ ikpochapu ọrịa yelo fiva Ihe a ga eme ka ọgwụ mgbochi a bụrụ nke kachasi gọọmentị mee gbasara ọrịa yelo fiva. Ọgwụ mgbochi a bụ maka ikpochapụ oria yelo fiva na afọ 2026. Ịgba Ọgwụ mgbochi a ga ebido na steeti Kogi, Kwara na Zamfara. Na Bornu Steeti, gọọmentị ga-enye ọgwụ mgbochi a n' ebe ndị na- agba ọsọ ndụ na-ebi (IDP camps). Mgbasa ọria yelo fiva na Naijiria ugbua Onye kwuru: WHO Gịnị bụ yelo fiva? Yelo fiva bụ ọrịa ahụụnta na-ebute. Ugbua, otu WHO na-ekwu na ọrịa ahụ amalitela na obodo Ifelodun na Kwara Steeti. Ha kwukwara na ihe dịka mmadụ nari atọ, ịrị ise na asatọ nwere ike ị nwe ọrịa yelo fiva na steeti ịrị na isi na ala Naijiria. Nke a emeela ka mmadụ ịrị na isi nwụọ. Gini ka akwusi oria yelo fiva? Ọ bụlụ na ịgba bere ọgwụ mgbochi, ihe ị kwesịrị ịme bụ ị kwụsị ọtịta ahụhụ n'ebuta iba. Ụlọ mgbochi anwụnta di mkpa ị kwusị ọrịa yelo fiva ""Anyị niile kwesịrị ị nwe ụlọ mgbochi ahụụnta. Naani ya ga kwụsị oria yelo fiva,"" Dọkịta Mgbolu kwuru." egwuregwu-51651437,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51651437,Real Madrid vs Man City: Manchester City apịala Real Madrid mgbachara ndị mmụọ,Manchester City ewerela mgbachara ndị mmụọ pịawaa Real Madrid azụ n'azụ ụlọ ha.,"Kevin De Bruyne Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka Man City ji merie Madrid n'asọmpi Uefa Champions League a gbara n'abalị Wenezde. Otu egwuregwu abụọ enweghị nke nyetere ibe ya goolu n'agba nke mbụ. Mana Madrid bu ụzọ nyete goolu nke si n'aka Isco. Oteghi aka, Gabriel Jesus satara ya, ebe Raheem Sterling gbatara penariti nke Kevin De Bruyne gbakpuru iji nye Man City mmeri. Nke ka njọ bụ na Sergio Ramos natara akwụkwọ ọbara ọbara n'asọmpi a, pụtara na ọ gaghị eso n'egwu mgbe Real Madrid ga-aga be Man City. Otu abụọ a ga-akụkọta mpi ọzọ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị nke afọ a, mgbe ha ga-ezute n'Etihad." afirika-45962557,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45962557,Amara Enyia: Gịnị mere Kanye West na ọtụtụ ndị Amerika ji akwado nwaada Igbo a?,Nwoke a ma ama na-eti egwu a kpọrọ Kanye West enyeela nwaanyị aha ya bụ Amara Enyia ego ruru puku narị paụnd iri ise na isii.,"Amara Enyia ekelela Kanye West maka ego o nyere ya Amara Enyia chọrọ iso n'ọsọ ntuliaka mba Amerịka dịka aka ga-achị obodo Chicago nke Bekee kpọrọ ""Mayor"". Onye egwu ọzọ a kpọrọ Chance na-akwadokwa ya nke ukwu. Amara Enyia na Chance Ha kọwara na ha nyere ya ego a ka o jiri kwụọ ụgwụ o ji ndị Illinois State Board of Elections maka ọsọ ọkwa Mayọ ọ gbara n'afọ 2015. N'ime ozi Enyia zipuru Kanye, ọ kelere ya nke ọma maka nnukwu onyinye ahụ. Enyia kwuru na ebumnuche ya bụ ị buso mpu na nrụrụaka na obodo ahụ. Ihe i kwesiri ịma maka Amara Enyia A mụrụ Amarachukwu Enyia na Baltimore, Maryland na mba Amerịka. Nne na nna ya bụ ndị Igbo, nna ya bụ ọkammụta na mahadum Governors State University n'obodo ahụ. Enyia bụ ọkaiwu, bụrụkwa onye ọkammụta n'ihe gbasara agụmakwụkwọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-51943646,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51943646,Coronavirus in Nigeria: Omume ndị anyị na-eme na-enye aka ịkesa ọrịa a,O fọrọ obere ihe ka ọrịa Coronavirus gbasa rue mba niile dị n'ụwa.,"Nke kachasị akpọtụ bụ na enwebeghị ọgwụgwọ ọbụla a ma ama ga-enye aka ịgwọ ya. Mana ndị sayensị na ndị ọnụ na-eru n'okwu enyeela ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ ga-esi gbochie nkesa ọrịa a. Ha gụnyere: ịkwọ aka gị, ịmechi ihu gị ma ịzee uzele nakwa ịbelata mmetụ ndị ọzọ ahụ bụ ""Social Distancing"" na bekee. 1. Ọtụtụ mmadụ ịbiko n'ime otu ụlọ Gọọmentị steeti dị ichiche amachiela ọgbakọ mmadụ karịrị iri ise n'ihi ofufe ọrịa a. Mana n'agbanyeghị nke a, ebe obibi ọtụtụ ndị mmadụ dị kpakọkpakọ. Ọ pụtara na ịnwereike ịchọta ihe dịka ezinaụlọ mmadụ asaa bi n'ime otu mkpuru, ma nwekwaa ihe dịka mkpuru iri n'ime otu ụlọ ahụ. 2. Ịnọju n'ime ụgbọala 'bus' Maka etu njem ụgbọala siri dị na ọtụtụ obodo Naịjirịa, ọ ga-ara ahụ ị nye mmadụ ibe gị efe maọbụrụ na ị na-apụ apụ Ịjị ma atụ, ụfọdụ ụgbọala na Legọs na-ebu mmadụ isee n'oche kwesiri ị ba mmadụ atọ. Ụgbọala ọzọ na-ebu ndị na-akwụkarị ọtọ ma ụgbọala ju eju nke ga-emeriri na ahụ ndị mmadụ metụrụ onwe ha. 3. Ị nọkọta ọnụ n'ọgbakọ ọbụla Ebe ọbụla ị hụrụ ọgbakọ ndị mmadụ na Naịjirịa dịka ahịa, ụlọụka, mmemme ndz, ndị mmadụ na-anọkarị onwe ha nso. Nke a ga-emekwa na ndị mmadụ ga-emetụta onwe ha ahụ nke ga-enye aka ịkesa ọrịa na-efe efe. 4. Ị bi n'ụlọ ezighi ezi dị kpakọkpakọ Ọtụtụ ndị mmadụ bi n'ụlọ arụchaghị ọfụma ma dịkwa oke nso n'ebe ha dị. Nke a ga-eme ka ọ raa ahụ ị me ihe bekee kpọrọ ""Social Distancing"" ga-enye aka ịbelata mgbasa ọrịa a. 5. Ị nwe ahịa na-ekwo ekwo Etu ahịa si dị ọ kachasị n'obodo ndị buru ibu dịka Legọs, Pọtakọt na ndị ọzọ na-ekwokwarị ekwo. Nke a pụtara na ahụ ndị mmadụ ga na-emetụ onwe ha. Mmetụ ahụ bụ otu ụzọ a ga-esi ekesa ọrịa a. Akụkọ ga-amasị gị Abule Ado Explosion: Onye bụ Henrietta Alokhai nke Bethlehem Girls?" afirika-54087281,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54087281,Orji Uzo Kalu: Ihe ọkaiwu Ipob sara ya,Alloy Ejimako bụ ọkaiwu indigenous People of Biafra ekwuola na Orji Uzo Kalu ekwesighị ị ga-agwa gọọmenti etiti ka ha nye ya ohere ka ọ kpọlata Nnamdi Kanu.,"O kwuru na ọ bụ eziokwu na enweghị iwu megidere ya bụ okwu, mana ihe o kwesiri ime bụ ịgakwuru Nnamdi Kanu rịọ ya ka o nye ya ohere ka ọ gakwuru gọọmenti etiti ka ha abụọ kpaa ihe gbasara Biafra. Ejimako kwuru na Nnamdi Kanu nwere ndị o dewere n'akụkụ bụ na ọ bụrụ na gọọmenti etiti chọọ ka ya na ha kpaa, ha ga-anọchịte anya ya. Lee ihe o kwuru n'uju ebe a. Ipob asaala Orji Uzo Kalu Ihe Orji Uzo Kalu na-arịọ gọọmenti n'isi Nnamdi Kanu Ọ bụghị Biafra dị ndị Igbo mkpa ugbua - Ọrji Uzo Kalu Orji Uzo Kalu, onye ji ọkwa ""chief whip"" n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, ekwuola na ọ bụrụ na gọọmenti etiti nye ya ohere na ọ ga-eje mba UK kpọlata onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Namdi Kanu. Kalu kwuru na isi sekpụ nti na mkparịtaụka ya na Nnamdi Kanu ga-abụ ka ọ hapụ okwu mwereonwe Biafra ma chọwa otu Naịjirịa. Onye enyemaka Uzor-Kalu bụ Peter Eze gwara BBC Igbo na Kalu gwara ndị ntaakụkọ 'News Agency of Nigeria' nke a mgbe ha na-agba ya ajụjụ ọnụ. Orji Uzor Kalu na Nnamdi Kanu Eze kwuru na Kalu gwara NAN na o kwenyesiri ike n'otu Naịjirịa. O kwuru na Orji Uzo Kalu ghọtara etu Naịjirịa dị nakwa etu ndị Igbo si nwee azụmahịa ebe niile nke pụtara na ọbụghị Biafra ka ndị Igbo kwesiri ị na-achọ. ""Ihe ndị Igbo ga-eme ugbua bụ inọdụ dịka agbụrụ ndị ọzọ sị nọrọ na-achọ ihe ndị ọzọ na-achọ."" "" Kalu chọrọ ka gọọmenti nye ha ohere ka ya na Nnamdi Kanu kpaa, ọ lọta n'obodo kwụsị ọchịchọ Biafra makana ọ bụ obere obodo agaghị eji tunyere nnukwu Naịjirịa."" ""Nke a ga aka bara anyị uru."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45594763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45594763,"Nwoke a a jiaka ya rụọ ebe a ga-eli ya, maka gịnị?","Ị chetula ebe a ga-eli gị ma ị nwụọ? Dọkinta Antony Mwandulami bi na Njombe dị na Tanzania arụọla ili ya na nke ndị nwunye ya atọ, ebe ha ka dị ndụ.","Mwandulami bụ dibia mgbọrọgwụ kwuru na e bidoro ịrụ ili ahụ kamgbe afọ asatọ gara aga. O kwuru na ọ chọrọ ime ihe e ji echeta ya ma ọ nwụchaa, ga-apụ iche n'ihe ndị obodo ha na-eme. Ọ ga-ewe ego ruru nde naira 162 tupu arụcha ya bụ ili. Ndị Tanzania katọrọ ili a eji nde naira 162 wee rụọ Mgbe onye ntaakụkọ BBC bụ David Nkya gara na be ya, ọ chọputara na ili ahụ bụ ihe tụrụ ndị Tanzania n'anya ma bụrụkwa ebe Mwandulami bi ụgbụa ma ruo mgbe ọ ga-anwụ. N'agbanyeghị na ndị obodo ya na-akatọ ego o ji rụọ ili a makana agụrụ na ụbịam dị na be ha, Mwandulami kwuru na ego ruru nde naira 162 adịghị ọtụtụ maka ịrụ ili ya. Mwandulami sị na ọ chọrọ ka ndị be ha gbasie ozu ya ma ọ nwụọ Ọ bụghị naanị ili ya na-agbọgwoju ndị mmadụ anya, ọ bụkwa arịrịọ ya ka a gbasie ozu ya ma ọ nwuọ. Ndị mmadụ na-ajụ gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nwụọ n'ọnọdụ agaghị e nwetali ozu ya, mbọ na ego niile o tinyere wee rụọ ili a, ọ ga-ala n'iyi? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49713268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49713268,Xenophobic Attack: Mba Saụt Afrịka arịọla Naịjirịa mgbaghara,Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa arịọla Naịjirịa mgbaghara taa maka okwu Xenophobia.,"Jeff Radebe bụ onye nnọchite anya pụrụiche nke Rampaphosa zitere na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ taa ebe ọ nọ zie ya ozi arịrịọ ahụ. Ọtụtụ ụmụ Naijiria hapụrụ mba Saụt Afrịka gbala n'ihi ogbugbu a na-egbu ha na mba ahụ., Ụfọdụ ka a gbara ngwaahịa maọbụ ụlọọrụ ha ọkụ. Nke a mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa na Naịjiria were iwe mebie ihe n'ọdọ ahịa Shoprite na PEP bụ ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nwe na Naịjiria. Mana agbanyegi nke a, ndị ntorobia mba Saut Afrịca sị na ha achọghọzị ndị mbịarambịara ọbụla n'obodo ha. Ọzọ, Ndị uweojii n'isiobodo Naịjirịa bụ Abuja akasiela ndị mmadụ obi na ha kwụ chịm ebe ahụ n'okwu gbasara nchekwa. Ha kwuru nke a n'ihi ụfọdụ akụkọ na-efegharị na ozuzu, ogbugbu mmadụ na ntọ na-arị ibe ya elu n'obodo ahụ. Na mba ofesi Ndị dọkịta Zimbabawe agbaala abụbụ ọrụ ma mee ngagharị iwe maka ntọrọ atọọrọ onyeisi otu ha bụ Peter Mugombeyi na-edu ha na ngagharị iwe mbụ. Mana gọọmentị ala agọrọla ụkwụ ha na ntọ nwa amadi ahụ ma nye iwu ka ndị ọrụ nchekwa tinye anya chọta ya. N'egwuregwu, David de Gea bụ onye oche bọọlụ otu Manchester United ebinyela aka n'akwụkwọ ịnọgide n'otu ahụ rue afọ 2023. Cheta na de Gea si otu Athletico Madrid banye Man United n'afọ 2011. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere Ụmụ Naịjirịa ọzọ ga-esi Saụt Afrịka bata Chairman /CEO, Nigerians In Diaspora Commission, Hon Abike Dabiri-Erewa A ga-akpọlata ụmụ Naịjirịa ọzọ ruru narị atọ na iri na itoolu site na mba Saụt Afrịka n'ụbọchị Tuuzde iri na asaa ọnwa Seputemba 2019. Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri sị na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-edebanye aha ha maka ịlọta. Ihe chere ndi si South Africa lọta N'aka nke ọzọ Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ezipụla ndị ọrụ ya ka ha gaa na mba Afrịka niile ndị mwakpo a metụtara. Dịka o kwuru n'akara twitter ya, na ndị a ji ozi udo na ịhụnnaya na-aga mba ndị a gụnyere Naịjirịa, Nijee, Ghana, Senegal, Tanzania na Zambia. Coscharis emepela ụlọ a na-eme osikapa A sị na akụ ruo ụlọ, ụlọ ama mma. Onyeisi ụlọọrụ Coscharis bụ Cosmas Maduka ehiwela ụlọọrụ na-arụpụta osikapa n'Anambra Steeti. A na-atụ anya na Gọvanọ Anambra bụ Willie Obiano ga-agbape ụlọorụ a n'oge na-adịghị anya. N'ofesi Ọnụego mmanụ agbịdị arịala elu nke kachasị ibe n'ime ọnwa anọ site na ogbunigwe a gbara n'ụlọọrụ mmanụ agbidi mba Saụdi Arebia n'ụbọchị Satọde. Dịka ọ dị ugbua, Saụdi Arebia akọwabeghị nke ọma etu mwakpo a si mee mana ha kwuru na onweghi onye merụrụ ahụ. N'egwuregwu Onye na-agbara Chelsea bọọlụ bụ Tammy Abraham sị na ohere dịrị ya ịgbara Naịjirịa bọọlụ ma ọ bụrụ na a kpọtụrụ ya A mụrụ Tammy Abraham na Ịngland mana o tozuru ịgbara Super Eagles bọọlụ maka nna ya bụ nwafọ Naịjirịa. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-51717717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51717717,Chelsea vs Liverpool: Chelsea akwọriela Liverpool kpọọ ha n'imi ka ụtaba,Ndị Chelsea jị ụtali igwe pịakaa Liverpool ahụ oge ha abụọ zutere n'asọmpi FA cup n'abalị Wenezde.,"Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji chụlaa Liverpool. Nkata ka Liverpool gaara iji buru goolu, mana ndị Chelsea riri ọtụtụ goolu ha kaara inye. William bu ụzọ nye goolu na nkeji 13, ebe Ross Barkley nyere goolu nke ya na agba nke abụọ. A ga-ama onye bụ 'azụ eru ala' n'etiti Chelsea na Liverpool ka ha ga-ezute n'asọmpi Iko FA n'iji tozuoke n'agba anọ nke ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị a. Obi adịla na mbụ koro ọtụtụ ndị nkwado ha n'elu maka na ọ bụ onye e meriri ọ kwakọrọ ngwonwo ya laarie. Mana dịka a sị na anaghị asọ mgbagbu ghara ọgụ', onye ọbụla nwere olileanya na otu ọ na-akwado ga-emeri. Ndị a ga-achọ achọ n'asọmpi a A bịa na Chelsea, ndị dịka Tammy Abraham, Ngolo Kante na Christian Pulisic agaghị agba bọọlụ ebe o dobeghi anya ma Andreas Christensen ọ ga-agba. Na Liverpool ndị dịka Jordan Henderson, Naby Keita, Xherdan Shaqiri na Nathaniel Clyne agaghị eso gbaa mana Joe Gomez na James Milner ga-apụta n'ọgbọ. Nke a mere ọtụtụ ndị ji eche na Liverpool nwereike imeri Chelsea tinyekwara na ha bụ ndị mbụ n'ogogo tebụlụ Premier League. Ugboro ole Chelsea na Liverpool na-ezute onwe ha n'asọmpi FA Nke a ga-abụ nke mbụ otu abụọ a ga-ezute ibe ha kamgbe ha zutechara n'agba ikpeazụ n'afọ 2012 mgbe Chelsea ji ọkpu goolu abụọ asatara otu merie. Chelsea emeriela Liverpool ugboro ise n'ime asọmpi FA asaa ha zuterela. Mana asọmpi a ga-abụ ugboro atọ ha ga-ezute onwe ha n'afọ a. Liverpool emeriela Chelsea ugboro abụọ gụnyere asọmpi Uefa Super Cup. Ajụjụ a na-ajụ bụ ma Liverpool ọ ga-ama afọ n'ala ọzọ dịka Watford gbachara ha ọkpụ goolu atọ n'ụbọchị anọ gara aga? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Gịnị bụ 'Super Tuesday' na ihe mere o jiri dị mkpa?" media-47996439,https://www.bbc.com/igbo/media-47996439,"Michael Jackson Vs Beyonce: Onye bụ obu, onye bụ nza?",Michael Jackson na Beyonce na-ewu na soshal midia dịka ndị mmadụ na-arụrịta ụka onye ka ibe.,"Nke a na-eme dịka akụkọ Mark Lester bụ otu onye ya na Jackson bụbu enyi boro ebubo imetọ ụmụaka megide Jackson na ihe nkiri a kpọrọ, 'Neverland Landing.' Michael Jackson bụ otiegwu mba Amerịka a ma ama mabụrụkwa onye na-ede ma na-agbakwa egwu ka okoso. N'aka nke ọzọ, Beyoncé Giselle Knowles-Carter nke a ma dịka Beyonce bụ kwa onye Amerịka na-eti egwu, na-ede ma na-agbakwa agba , onye bidoro iwu na agbata afọ 1990. @Ediong kwuru na o nweghị onye ga-adịka Michael Jackson ma n'ọnwu , ebeBeyonce rerela efere egwu ihe karịrị nde 17 ugbua intanet dị, ma Michael Jackson rere efere egwu 750. @Tjames_Debayo kwuru na Beyonce bụ agbara mana onweghị ka o siri rute Michael Jackson. @Royaltyuso dụrụ ọdụ ka mmadụ ghara iji Beyonce tụnyere Michael Jackson na agbanyeghị ihe niile o merela na ime nke a bụ iwetu ya ala. Nzere Michael Jackson Jackson, onye bidoro iti egwu na nwata n'otu egwu, ""Jackson 5' ndị bụ a n'ụmụnne ya eritela nturugo gụnyere: Nzere Beyonce Beyonce, onye bidokwara iti egwu na nwata n'otu egwu, 'Destiny Child'ritere gụnyere: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48405241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48405241,Parent and children relationship: Kedu ihe mere nne na nna anaghị ama echiche ụmụ ha?,BBC Igbo kpọrọ ndị ọbịa pụrụiche ka ha bịa tịnye ọnụ n'okwu gbasra ọdịmma ezinaụlọ.,"Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu Anyị nwere mkparịta ụka miri emi maka uru ọbara ime ka enwee ezigbo mmekọrịta n'etiti nne, nna na ụmụaka n'ezinaụlọ. Pamela Udọka Ndị bịara mmeme a bụ Steve Obumneke Orajiakụ bụ onye nkuzi na mahadum nakwa onye ntaakụkọ. Pamela Udọka bụ onye klinika saịkọlọjist bụ ndị na ahụ maka ọdịmma ahụike nke ụbụrụ. Onyi Syn Osuchukwu bụ onye edemede na intaneti Bekee kpọrọ ""blogger"". Ndị a niile tinyere ọnụ n'okwu a dị mkpa ọkachasị ụgbụa ụmụaka na-egbu onwe ha n'ụzọ mmerụala. Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu Ihe ha kwuru maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị Maka ajụjụ gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị, Obumneke kwuru na ihe niile nwere oge, mana na nwata ruo ihe dịka afọ iri na atọ, na nne maọbụ nna nwere ike ịgwa ya ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Obumneke onye Onyi Syn sị na ọ bụ nne na nna ka ọ dịrị inyere ụmụ ha aka site n'ịjụ ha ajụjụ gbasara ha. Pamela kwetakwara na e kwesikwara imalite na nwata kpawara ụmụaka nkata gbasara ahụ ha. Anyị jụkwara ha mgbe ekwesiri ịnye ụmụaka ekwentị. Onyi Syn Osuchukwu Ebe pamela sị na ọ bụ mgbe nwata ruru afọ iri na atọ. Obumneme sị na ọ bụ mgbe nwata ruru afọ anọ ebe Onyi sị na nna ya nyere ya ekwentị mgbe ya gbara afọ iri na ise iji sị ya deeme ọrụ maka ịgafe ule nke mahadum. Leezie ihe ha kwuru n'uju ya: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53605208,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53605208,Anyị amaghị na ụmụakwụkwọ Naijiria nọ China sị na ha agaghi akwụnwụ ụgwọ 'evacuation' - Air Peace,Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ Ụgbọelu Air Peace bụ Stanley Olisa gwara BBC Igbo na ha amaghị maka mkpesa ụmụakwukwọ Naịjirịa gụchara na Chaịna kpesara banyere ego eji agba ụgbọelu ha eji alọta.,"Maazị Olisa sị na ya amachaghị ego ole a sị ka ndị ga-eso na njem nlọta a kwuọ, mana ọ bụ ngalaba na-ahụ maka Naijirịa na Chaịna ka ọ di n'aka. Ụmụakwụkwọ Naijiria a gụchara na mahadum mba Chaịna n'afọ 2020 tọrọ na mba ahụ n'ihi mmachi obodo dị na mbaụwa nke ọrịa coronavirus butere. Dịka ha siri kọwaa, ihe karịrị ụmụakwụkwọ narị abụọ (200) ndị gụchara akwụkwọ mahadum nsonso a bụ ndị ihe metụtara. Ha gwara BBC Igbo na gọọmentị Naijiria na Ụgbọelu 'Air Peace' nwere nkwekọrịta ibulata ha, mana ụgwọ ụgbọelu nke bụ otu puku dọla na narị anọ ($1,400) nke ruru puku narị isii na iri ise na asatọ (N658,000) na Naịra, karịrị ha aka n'ihi na ọ bụ mmaji atọ ihe a na-akwụbu maka ife ụgbọelu. Otu n'ime ụmụakwụkwọ ndị ahụ nke achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na""Ụdịrị mmadụ dị iche iche tọrọ na Chaina; ụfọdụ ndị ojiegoachụego, mana ndị ọ kachasị metụ bụ ụmụakwụkwọ."" ""Ọtụtụ ụmụakwụkwọ nke a metụtara bụ ndị nwetara ohere agụmakwụkwọ n'efu, ha enweghị onye ga-akwụrụ ha ụgwọ a."" Ebe okwu ha siri ka njọ bụ na oge e nyere ha n'akwụkwọ njem nke Bekee kpọrọ 'visa', ga-ebi n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Julaị, nke afọ 2020. Mba Chaịna nyere ha amara ọnwa abụọ ọzọ, mana ha tụrụ arịrị na ha enweghị ego nri na ụgwọ ụlọ dịka ha enweghị akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ na mba Chaịna. Nsogbu ọzọ ha nwere bụ na ha amabeghi ụbọchị gọọmenti ga-abịa ebulata ha iji mata etu ha ga-esi akwado onwe ha maka irute n'ọdọụgbọelu. Mbọ BBC gbara ịnụta olu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụ Naijiria bi n'ofesi bụ NIDCOM n'aha ịchafụ, amịtaghị mkpụrụ dịka onyeisi ha bụ Abike Dabiri-Erewa asabeghị ozi e zigara ya n'ekwentị oge akụkọ a na-apụta. BBC gbakwara mbọ inweta ndị nnọchịte anya Air Peace, mana onye nke zara ekwentị ya sị na ya enweghị ikike ikwu okwu banyere okwu a. Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-50294336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50294336,Nne ụmụaka atọ ụlọ aja dagburu n'Ebonyi amabeghị na ha nwụrụ,Ụlọ Mazi Sunday Okereke na ezinaụlọ ya bị n'obodo Akaeze dị n'Ebonyi steeti bụ nke dagburu ụmụ ya atọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba a ka nnukwu mmiri zochara.,"Etu ụlọ aja si dagbuo ụmụaka atọ n'Ebonyi Ndị ezịnaụlọ Okereke nakwa ndị Akaeze niile ji anya mmiri were kwuo na ụdịrị ọdachi ahụ emebegh na be ha mbụ. Nne ụmụaka atọ nwụrụ ka nọ n'ụlọ ọgwụ Sunday Okereke kọwara BBC na ya gara ikiri egwuregwu bọlụ ụbọchị ahụ, nke mere na nwunye ya na ụmụ ya anọ na arahụ ụra oge ya bụ mkpamkpa kpara. Sunday ji anya mmiri kwuo na ngwa ngwa mmiri zochara ka akpọrọ ya na ekwentị sị ya gbata ọsọ na ụlọ ya adaala. Mgbe o rutara, ọ hụrụ ozu ụmụ ya atọ, ebe nwunye ya na dị ọkpara ya ka dị ndụ ma nọrọ n'ụlọ ọgwụ. Ụlọ aja ka dịn'ọtụtụ obodo na Naịjirịa Nwanne Maazị Okereke bụ Emmanuel Okereke ma bụrụkwa di ọkpara ha na ezinaụlọ ahụ yọrọ ka agbatara ha mkpu enyemaka n'ihi na nwunye nwanne ya nwa ya nwoke pụtara n'ụlọ dara ada ka nọ n'ụlọ ọgwụ. Emmanuel okereke kwuru na ihe kpatara ya bụ ụlọ jiri daa bụ n'ihi na ọ bụ ụlọ aja. Eze na-achị Akaeze bụ Ezeogo Joseph Onu kwuru na ndị obodo ya akpala ka ha ga-esi dota ezinaụlọ ahụ ebe ha ga-ebi ganye na ha arụọ ụlọ ọzọ. BBC Igbo gara na ụlọ ọgwụ akpọrọ Health Messenger nke dị na Akaeze junction ebe nne ụmụ aka ahụ bụ Elizabeth Okereke na di okpara ya nke dị ndụ na anara ọgwụgwọ. Eliela ụmụnne atọ a nwụrụ mana nne ya na nwane ha nwoke ka nọ n'ụlọ ọgwụ Elizabeth enweghi ike ikwu okwu nke ọma mana nne ya kelere chukwu na agbanyeghị na ụmụ ụmụ ya atọ nwụrụ mana nwa ya nwaanyị ka dị ndụ tata. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54136904,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54136904,Ị nụla maka ọrịa 'Bovine Tuberclosis' na-arịa ehi n'Abia?,Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Abia bụ Ikechi Mgboji adọọla ndị Abia aka na ntị ha ghara iri anụ ngụgụ ehi ọbụla nọ na steeti ahụ ugbua.,"Ọrịa ọhụrụ ejituola ehi nọ n'Abia steeti O kwuru na ọ bụ ka ha ghara ibute ọrịa ọ kpọrọ ""Bovine Tuberclosis"" nke a chọpụtara na steeti ahụ ọhụrụ a. Ọkammụta Mgboji kwuru na ya bụ ọkwa adịla mkpa maka nchọpụta etu ọrịa ahụ si metụta ehi ndị a. Gịnị bụ 'Bovine Tuberclosis'? Nke a bụ ọrịa otu nje a kpọrọ ""Mycobacterium bovis"" nke metụtara nje na-ebute ụkwara nta (Tuberculosis) a na-ahụ n'ahụ mmadụ maọbụ nke nnụnụ. Mgboji kwuru na a chọpụtara ya bụ nje n'izuụka abụọ gara aga n'Aba. Njirimara ọrịa a Mgboji kwuru na njirimara ọrịa a bụ ntitu ahụ niile , oke ụkwara na ọnwụ. Mgboji kwuru na ọrụ ha bụ i site n'aka ndị dọkịta na-elekọta anụmanụ mee nyocha ehi ọbụla akpụpụtara maka ogbugbu nakwa iresi ọha. N'okwu ya"" o nweghị ka ị ga-esi mata ehi orịa a ji karịa igbu ya maọbụ nyochaa ehi ahụ."" ""Nke a mere anyị ji sị ndị mmadụ ka ha ghara iri ngụgụ anụ ehi ugbua mana ha nwereike iri akụkụ ndị ọzọ. Mgboji kwuru na ụlọọrụ ya agwaala ndị dọkịta na-elekọta anụmanụ na-anọ n'ebe a na-egbu anụ ka ha kee nkwụcha ma chọpụta ehi ọria a ji ma ghara ikwe ka e resi ya ọha. Ihe ministri ahụike Abia steeti kwuru maka ọrịa a Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Abia steeti bụ Jonathan Osuji kwuru na o nweghị ihe o nwere ikwu maka ya bụ ọrịa ji anụ ehi na steeti ya. O kwuru na kọmishọna ọrụ ugbo ma ihe mere o ji kwupute ọkwa ahụ ọ mara maka ngụgụ anụ ehi mana o mebeghi ka ngalaba ahụike steeti Abia mara maka ya. N'iza ajụjụ, Oriaku Nwadiuto Nwankwu onye bụ onyeisi oru ahụike n'ebe a na-egbu anụ n'Ubakala di n'ọchịchị ime obodo Umuahia South siri na ha na-arụ ọrụ ha nke ọma ịhụ na-echekwara ndụ ndị nata anụ ehi n'akụkụ steeti Abia ebe ha na-elekọta. Ọ kọwara na ha na-enyocha ehi ọbụla tutu egbu ya nakwa mgbe egbuchara ya, ma nakwa etufu anụ ọbụla ahụrụ na o bu nje ọbụla. Ndị n'egbu anụ na ndị nrekwa anụ ndị tinyere ọnụ na okwu a siri na ọmama ọkwa ahụ gọọmentị mara isi ka aghara iri akụkụrụ anu ehi Awusa, adoghachila eke ekekere azụ na mgbere anụ ha n'atu. Ihe ndị na-egbụ anụ kwuru Dika onye ọrụ nchekwa ahụike ogbe ahụ siri na ha na-eme ezi nyocha tutu, nakwa mgbe egbuchara anụ niile na ọdọ ebe ahụ ana egbu ehi n'Ubakala, onye ode akwụkwọ ndị otu na-egbu ehi n'ebe ahụ bụ Maazi Jacob Uwalaka, kwenyere na-ọbụ eziokwu, ebe ọ nọkwa na ekwusi ike na ọdịghịi mgbe ọbụla ha ga-ekwe ka ebubatara ndị obodo anụ ọbụla bu oke rie ọ nwụọ. Ọ bụ ezie na Kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ụbị n'Abia steeti anọghị n'oche ya, otu onye ọrụ gbapụtara ihe n'ụlọ ọrụ ahụ, siri na ọ dịghị ihe dịka ndị ọrụ ọtawaike ha tinyere iji hụ na ndị n'egbu anụ ehi Awusa rubere isi igbu nakwa ire nani ehi Awusa nke na-enweghi nsogbu ahụike ọbụla.Onye a na-achọghị ka akpopụta aha ya sikwara na ọ bụ ezie na-achọpụtala ọrịa Bovine Tuberculosis n'ime steeti Abia, ma sikwa na ọ bụ nani n'obere ọnụ ọgụgụ." afirika-45048684,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45048684,NYSC: Ụmụ Naijiria achọghị ka e jiri azịza zafuo ebubo eboro Adeosun,Otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Socio-Economic Rights and Accountability Project'(SERAP) abọlitela okwu gbasara Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosu ọzọ.,"Adeosun ṅụrụ iyi ọrụ dịka minista n'afọ 2015 Izu ole na ole gara aga, akụkọ pụtara na Adeosun ejighị otu afọ fee ala Naijiria dịka iwu siri kwuo, kama ọ gara kpụọ asambodo adigboroja nke na-ekwu na ọ karịala afọ eji eme ya. Mana taa bụ Tọọsde, Serap nyere ngalaba gọọment na-ahụ maka iji otu afọ fee ala Naijiria bụ NYSC n'aha ịchafụ abali asaa iwepụta akwụkwọ na ozi na-egosi nke bụ eziokwu n'ebubo eboro Adeosun na ọ kpụrụ asambodo adịgboroja. N'ozi Serap wepụtara na Twitter, ha kwuru na nkịtị ndị isi NYSC gbara n'okwu ahụ nwere ike igosi na o nwere mpụ e mere ma bute ịtụ aka na ha nwere ihe ha na-ezo banyere ihe mere. Lee ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka ya: Ogbuehi Victor kwuru na ọgala abali 25 kemgbe ụlọakụkọ Premium Times wepụtara akụkọ gbara ama maka Adeosun na asambodo adịgboroja mana onyeisiala Buhari, EFCC nakwa ndị uweojii mere, ebe APC na-alụso Saraki ọgụ. Nafiu T na Ben Tuyi jụrụ afọ ole ọ ga-ewe NYSC ịlebanye anya n'akwụkwọ ha ịchọpụta maka asambodo akụrụ akụ nke Kemi Adeosun? Ụfọdụ na-akpọ oku ka e mee ngagharịiwe iti mkpu ka Adeosun rida n'ọkwa minista maka ebubo ịkpụ asambodo adigboroja. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48090155,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48090155,New Passport: Gọọmentị ebidola ikesa akwụkwọ njem ọhụrụ,Ngalaba na-ahụ maka njem na Naịjirịa ebidola ikesa akwụkwọ njem ọhụrụ nke ga-anọru afọ iri.,"Onye ọbụla chọrọ akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-eweta akara njirimara ya nke bụ National Identity Number na Bekee. Ihe ọzọ ga-adị iche n'akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-abụ ego ole ọ dara. Ọ ga-esi na otu narị dọla gbalite rue narị dọlla abụọ na iri atọ dịka ngalaba NIS siri kwuo. Akwụkwọ njem ọhụrụ a ga-eme ka ndị Naịjirịa na-aga njem kwụsị ịnweta nke ọhụrụ kwa afọ ise. Onyeisiala etinyela ọnụ n'okwu Zainab Aliyu Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola ka ndị aka ha dị n'ihe gbaa mbọ hụ na akpọlatara Zainab Aliyu. Zainab Aliyu bụ nwata nwaanyị Naịjirịa eboro ebubo na o bụ ọgwụ ike bata na mba Sawụdi Arabịa. Ozi a si n'akara Twitter nke Bashir Ahmad bụ onye enyemaka onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi. Ikpe ịbubata ọgwụ ike na mba Sawụdị Arabịa bụ ikpe ọnwụ. Gee Nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Anụ kanda adịgboroja Gọọmentị Legọs adọọla ndị mmadụ aka na ntị banyere ụdị kanda adịgboroja nọ n'ime ahịa ugbua nke bu nsi n'ime ya. Gọọmenti kwuru na ha anwụchiela mmadụ atọ aka ha dị n'ire ụdị kanda na-egbu egbu na mpaghara Okpuru Ọchịchị obodo Ojo na Iba ma kpachi kwa anụ ha ji. Kọmishịọna na-ahụ maka ahụike na steeti legọs bụ Jide Idris kwuru na ndị a na-ere anụ n'elekere anọ rue elekere isii nke ụtụtụ. Idris dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachara anya tupu ha azụọ ma ọ bụ rie anụ kanda ma mee kpesa banyere ụdị kanda adịgboroja ọbụla ha hụrụ. Atọhapụla ndị Chaịna atọọrọ n'Ebonyi Steeti A tọhapụla ndị mba Chaịna abụọ atọọrọ n'Ebonyi Steeti n'ụbọchị Wednezde izuụka gara aga mgbe ha na-arụrụ gọọmentị Ebonyi Steeti ọrụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Oda kwuru na ọ bụ ndị uweojii zọpụtara ndị na-enweghi ọkọ ọbụla kọrọ ha n'ahụ. Loveth kwuru na ndị ntọrị a gbahapụrụ ha n'ime ọhịa dị n'akụkụ ebe a tọọrọ ha n'ihi ọkụ ndị uweojii na-akwa ha n'ike. N'aka nke ọzọ ndị ntọ tọọrọ mmadụ atọ na-arụ n'ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na Rivers Steeti n'ụbọchi Satọde. Ndị a atọọrọ gụnyere ụmụafọ Canada, Naịjirịa na Scotland. N'ofesi Pati na-achị na Spain enwela mmeri na ntuliaka mba ahụ mere ụnyaahụ. Nke a ga-enye aka na-achị Spain bụ Pedro Sanchez na pati abụọ ohere ọzọ inwe nkwọrịta ihazi gọọmentị ọhụrụ. N'akụkọ ọzọ Ihe onyonyo Avengers: Endgame abụrụla ihe nkiri kachasị kpata ego na mmepe ya dịka oritere otu ijeri dọla na ọma abụọ. Ihe nkiri a ji abalị ise kpata ego a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu" afirika-47509183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47509183,Ethiopian Airline Crash: Pius Adesanmi so na mmadụ 149 nọ n'ụgbọelu kpọkasịrị,"Ụlọakwụkwọ ebe ọ na-akụzi nkuzi, ezinaụlọ ya, ndị enyị na ụmụ Naijiria nọ n'iru ụjụ maka ọnwụ Pius Adesanmi.","Ebe ụgbọelu Ethiopia Airlines bu Pius Adesanmi na ndị njem ndị ọzọ kpọkasịrị Nwafọ Naijiria a ama ama mabụrụkwa onye nkụzi mahadum 'Carleton University' dị na Kanada bụ Pius Adesanmi na Amina Ibrahim Odowa na nwa ya dị afọ ise so na mmadụ 149 nwụrụ n'ụgbọelu Ethiopian Airlines kpọkasịrị ụbọchịụka. Ụgbọelu Ethiopian Airlines Boeing 737 ahụ bu ndị mmadụ si isiobodo Addis addis Ababa na-aga Nairobi dị na Kenya, kpọkasịrị n'obodo Bishoftu. E nweghị otu onye rịpụtara n'ụgbọelu ahụ ka a chọtara ya ebe ọ dara. Onye nwe Sahara Reporters bụ Omoyele Sowere gwara BBC na ya na nwunye Adesanmi kpara o were kwuo na akụkọ ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-ekpe ekpere ka ọ bụrụ ajọ nrọ bụ eziokwu. N'ozi ha wepụtara n'igwe Twitter ha, ụlọakwụkwọ ahụ tụrụ arịrị maka ọnwụ Adesanwmi bụ onyeisi ngalaba mmụta ihe gbasara Afrịka na mahadum ahụ. @KadariaAhmed kwuru na ọnwụ ya riri ya ọnụ. @realseunwilliam kwuru na Adesanmi bụ onye okwu gbasara ala nna ya na-anọ ọkụ n'obi Onye bụ Pius Adesanmi? Ọkammụta Adesanmi, onye Isanlu dị n' Okpuru Ọchịchị Yagba East na Kogi Steeti bụ onye na-ede akwụkwọ a ma ama. Akwụkwọ derela gụnyere 'The Wayfarer and Other Poems', 'You're Not a Country, Africa' na 'Naija No Dey Carry Last.' Onye ọnụ na-eru n'okwu, Adesanmi na-edere ụlọọrụ ntaakụkọ 'Premium Times' na 'Sahara Reporters' ụka n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị obodo. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Ilorin,' mechaa gaa Mahadum 'University of Ibadan' nakwa 'University of British Columbia.' Ndị ụlọorụ ahụ kwuru na ndị si mba 33 nọ n'ime ụgbọelu ahụ, gụnyere otu onye Naịjirịa. Lee mba ndị nọ n'ụgbọelu ahụ si: Otu ọnụ na-ekwuchitere ụlọorụ ahụ, kwuru sị na ụgbọelu ahụ kpọkasịrị ebe elekere asatọ nke ụtụtụ taa bụ Maachị 10, n'ime obere oge o ji fepụ n'Addis Ababa. Onyeisiala mba ha bụ Abiy Ahmed kwuputara okwu nkasiobi ya n'elu Twitter. Ethiopian Airlines so n'ụlọorụ ụgbọelu ndị mmadụ ji nwee ntụkwasịobi makana ọ naghị adanye n'ọdachi aghara agahara, n'agbanyeghi na otu ụgbọelu ha kpọkasịrị n'afọ 2010, gbuo mmadụ 90 ka o si Beirut felie. Ọzọ bụkwa mgbe otu onye nọ na-achọ ịpụrụ ụgbọelu ha n'ike ka o si Addis Ababa na-aga Nairobi n'afọ 1996. O gburu mmadụ 123 n'ime 175 ka ọ kpọkasịrị." afirika-51152991,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51152991,'Sepsis' ọrịa na-egbu rue ka kansa,"Kwa afọ, otu n'ime mmadụ ise na-anwụ site n'ọrịa 'Sepsis' nke bụ ọnọdụ na-adapụta oge nje banyere ọnya maọbụ oghere n'ahụ mmadụ.","Ewezụga imebi ihe dị ezi mkpa n'ahụ mmadụ, ọrịa a na-egbu mmadụ ruo ka ndị na-anwụ site n'ọrịa kansa. Dịka nchọpụta WHO siri kwuo, mmadụ nde isii na-anwụ n'ihi ọrịa 'sepsis' kwa afọ, ebe kansa na-egbu mmadụ nde itoolu n'ụma. WHO kwụkwara na n'ime otu n'ime mmadụ iri nwụrụ n'ịmụ nwa, ihe karịrị pasent 95 bụ 'sepsisi na-ebute ya. Gịnị bụdị 'Sepsis'? Akwụkwọ 'English-Igbo Medical Dictionary' kọwara 'sepsis' dika ""nje ịbanye n'ọnya maọbụ n'ọrịa nke na-eme ka o ruo abụ."" N'otu aka ahụ, Dokịta Ikechukwu Okoroafor kpọrọ ya ọrịa nje ịbanye mmmadụ n'ahụ. Na nkowa ya, Dọkịta Okoroafor kwuru na ọrịa a na-adị ụzọ abụọ; 'Sepsis' na 'Septicaemia. ""Septicaemia bụ nje ahụ ịbanye n'ọbara mmadụ."" Sepsis bụ nje ịbanye n'ọnya maọbụ n'ọrịa nke na-eme ka o ruo abụ Ọ gara n'ihu kwuo na afọ jọrọ ọrịa 'sepsis' njo n'ihi na ""o nwereike imebi akụrụ, imeju maọbụ obi mmadụ ma gbuo onye ahụ ma ọ bụrụ na a chọpụtaghị ma gwọọ ya n'oge."" Onye ọ bụla nwere 'infection' nwere ike ọ banye na 'sepsis'. Njirimara ọrịa 'sepsis' gụnyere: Ihe e ji agwo 'sepsis' Ọgwụ na-egbu nje a kpọrọ'antibiotics' ka eji agwọ 'sepsis'. Uzo e si ebute 'Sepsis Dika Dọkịta Okoroafọ siri kọwaa, e nwere ike ibute ọrịa 'sepsis site na; Ụzọ mgbochi Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45280128,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45280128,Igbo Ekunie: 'Tọpụnụ ụmụnwaanyị Ipob e ji eji',"Ndị uweojii n'Imo steeti nwuchiri ụmụnwaanyị otu Ipob ruru otu narị maka ime ngagharịiwe n'Owere n'ụbọchị Fraide, izuụka gara.","Ụmụnwaanyị ndị a so na ndị ruru puku abụọ si na steeti dị iche iche n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mere ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu. Mana akwụkwọ ozi otu Igbo Ekunie Initiative wepụtara nke onyeisi ha bụ Tochukwu Ezeoke na odeakwụkwọ ha bụ Lawrence Nwobu binyere aka, otu ahụ katọọrọ nwụchi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nwụchiri ụmụnwaanyị ahụ ma kpọọ oku ka atọhapụ ha n'egbughi oge nakwa na-enyeghi ọnọdụ ọbụla. Otu a katọrọ ndị uweojii maka nwụchị ụmụnwaanyị ahụ ndị ha kwuru na ha ejighi ngwa ọgụ ọbụla iwu megidere wee mee ngagharịiwe maka Nnamdi Kanu ka na-efu efu ugbua. Ụmụnwaanyị Biafra n'emume ncheta ụbọchị Biafra ""Anyị nọ n'oge ọchịchị onyekwuouche ya. O kweghi nghọta na ọkpaike S.K. Durumba onye a kpụtara ụmụnwaanyị a n'ihu ya agaghị eji enye mkpebi sị ka ụmụnwaanyị ndị a lawa dịka ọ dị n'iwu. dịka o kwuru na ikpe ahụ karịrị ụlọikpe ya."" Ha gara n'ihu kwuo na 'ọ bụ ihe mgbakwuojuanya, "" ngalaba gọọment na-anọ n'ụra ma ndị Fulani ọchịehi na-egbusị ọtụtụ mmadụ gara nwụchie ụmụnwaanyị Igbo ji obi udo na-eme ngagharịiwe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43119689,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43119689,Atịtị egbuola ihe ruru mmadụ 17 na Mozambique,"Ihe ruru mmadụ 17 anwụọla n'isi obodo Maputo dị na Mozambique, ka nnukwu atịtị dagidere ụlọ ha.","Ndị ọrụ gọọmentị kwuru sị na ahụbeghị ọtụtụ ndị bi ebe ahụ ịma ma ha adị ndụ Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ merụrụkwara ahụ oge ikpo atịtị a, ụfọdụ hacha mita 15, bidoro ịda oge nnukwu mmiri ozuzo bidoro izo n'isi ụtụtụ taa bụ Febrụwarị 19. Ndị ọrụ mgbapụta ka na-achọ ma onwere ndị ka tọrọ n'okpuru atịtị a. Ndị obodo Maputo hụrụ nnukwu mmiri ozuzo kemgbe ụnyaahụ, nke mebichara ụlọ ma gbazuchaa ide n'ụzọ. Ọtụtụ ngwongwo ndị mmadụ mebichara n'ihe mberede a mere ka ndị mmadụ na-arahụ ụra na Hulene, Maputo, bụ otu n'ime obodo kacha daa ogbenye. Ndị ọrụ mgbapụta na-abọkasị atịtị ịma ma onwere ndị dị ndụ ha ga-ahụ Ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata bụ Leonilde Pelembe dọrọ aka na ntị sị na ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike ịka nọrọ n'okpuru atịtị a. O kwuru sị, ""akụkọ anyị nwetara n'aka ndị ọrụ gọọmentị ime obodo ahụ bụ na ọnụọgụgụ ndị bi n'ụlọ a ihe a mere karịrị ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ edere ede. Ndị ntaakụkọ Reuters kwuru sị na ndị ọrụ gọọmentị sị na ha agwabuola ndị bi ebe ahụ kwapụ maka na ha bi n'ụlọ ndị iwu machiri. Mana otu onye bi ebe ahụ nwa ya nwoke so na ndị merụrụ ahụ a kpọrọ Maria Huo, kwuru sị "" E bi m n'agbataobi a maka na enweghị m ebe ọzọ m ga-aga. Ọ bụrụ na ndị gọọmentị gwara m gaa biri ebe ọzọ, a gaara m apụ ebe a.""" afirika-52143303,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52143303,"Coronavirus Lockdown: Ugbua I nwere ohere, lekwa ihe I kwesịrị ikuziri ụmụ gị","A na-ekwu na ụmụaka bụ onyinye si n'aka Chineke mana ịchịkọta ha ugbua dịka gị na ha nọ n'ụlọ n'oge mmachi ngagharị maka ọrịa coronavirus, adịghị fechafecha.","Kedụ ka ọ si aga na be gị? Cheta na ndị nke ka nọ n'ụlọakwụkwọ ọtaakara maọbụ praịmarị agaghị aghọtacha ihe na-eme. Mana ndị nke na-agụ sekọndrị nwere ike ịghọta ihe ha ji nọrọ n'ụlọ apụghị iro. Ihe ka mkpa ibu n'obi bụ na ụmụaka mechiri akwụkwọ n'oge erughị eru nke mere na ha amụchaghị ihe niile ha kwesịrị ịmụta. Ọtụtụ nne na nna bụ ndị na-apụ n'ụtụtụ ma bata n'abalị, nke bụ na ndị nkụzi na ndị na-eledo ụmụaka anya bụ ndị na-ahụzi maka ọzụzụ ụmụaka. Mazi Peter Ezembu bụ onye ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara ọzụzụ ụmụaka tụnyere anyị azụ etu nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha ihe n'oge mmachi a. Kuziere ụmụ gị onye ha bụ Mazi Ezembu kwuru na dịka nne na nna na-akụziri ụmụ ha agụmakwụkwọ n'oge a, ọ dịkwa mma ka e were ohere a kuziere ha maka omenala ha. O kwuru si: ""Nne na nna ọrụ e nyeghị oghere ịkụziri ụmụ ha asụsụ na omenala obodo ha ga-eji oghere a kụziere ha asụsụ ha. Ezembu rụrụ aka iji akụkọ ifo na ụfọdụ egwu ndị Igbo ji kụziere ụmụaka ọmụmụ n'oge mmachi a. Kụziere ha maka ezinụlọ ha sị Ezembu si na ugbua bụkwa ohere iji kpọtụrụ ndị ezinaụlọ na-ekwentị nke onyonyo ma mee ka ụmụ gị mara ndị bụ ụmụnne ha. Ọ kwuru na nke a na-enye aka n'otuto ụmụaka. Ezembu kwuru sị, ""oge a a bụchaghị ogbatauhie dika ọtụtụ ndi nne na nna si chee, kama ụnụ were ohere a kụziere ụmụaka ụnụ ọmụmụ maka omenala na ezinaụlọ ebe ha siri bia"". N'aka nke ọzọ, e nwere ụfọdụ atụmatụ nne na nna ga-eji hụ na ụbụrụ ụmụ ha akpọchighị n' oge a, ọkachasi ndị na-akwado ule dịka WAEC. Atụmatụ ndị a gunyere: Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Coronavirus tips: Ite okuma o nwerike igbochi coronavirus" egwuregwu-50564327,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50564327,Valencia v Chelsea: Valencia amụwala Chelsea anya ka azụ,Ihe otu Chelsea tụrụ anya emeghiri ha n'abalị Wenzde dịka ha na otu Valencia gbara onwe ha onye laba onye laba.,Ọkpụ goolu abụọ nke Valencia ji nweta nhatanha bụ ihe tụrụ ndị Chelsea na-anya. Carlos Soler bu ụzọ nye goolu mbụ n'asọmpị ahụ na nkeji 40. Kovacic nke Chelsea sara goolu ahụ Soler nyere na nkeji 41 n'agba nke mbụ. Ogbo ya bụ Pulisic so kwa ya n'azụ na nkeji 50 mgbe o nyere goolu nke ya. Chelsea bidoro ịgba mbọ jide ka ha ji rue ngwụcha asọmpị ahụ mana nke ahụ emeghị. Ọ fọrọ obere ihe ka ogbu opi gbuo opi ya na nkeji 82 mgbe Wass nke Valencia nyere goolu ya. Rodrigo Moreno majara Chelsea na nkeji 96 dịka ọ fọrọ obere ihe ka o nye goolu mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Onye laba onye laba a ha gbara onwe ha pụtara na o nweghi onye n'ime ha ga-agaru agba nke ọzọ. Chelsea ga-ezutekwa Lille n'izuụka abụọ na-abịa ebe Valencia ga-ezute Ajax. Lee ihe otu Chelsea kwuru maka asọmpị a Akụkọ ndị ga-amasi gị 44890086,https://www.bbc.com/igbo/44890086,"Na Zamfara steeti, mmadụ ruru 27 anwụọla na mwakpo ndị ohi ehi",Ndị bi n'okpuru ọchịchị Maradun na Zamfara steeti nọ n'ime iru ụjụ dịka ndị na-ezu ohi ehi wakporo imeobodo ise ma gbuo mmadụ ruru 27 ma merụọ 10 ahụ.,"Na Zamfara steeti, nsogbu ndị ohi ataala isi ọtụtụ mmadụ na ọtụtụ ehi Otu onye bi na Gidan Goga, otu obodo so n'ime ise ahụ ndị ohi-ehi wakporo bụ Makau Malikawa kwuru n'ezie na ndị omekome ahụ wakporo ime obodo ise, merụọ mmadụ iri ahụ. Malikawa kwukwara na otu n'ime mmadụ iri ahụ merụrụ ahụ nwụrụ n'ụtụtụ taa(Tọzde), ebe ndị ụfọdụ ka nọ n'ụlọọgwụ ịnata nleta. Ọ gara n'ihu kwuo n'obodo ndị ihe a metụtara tọgbọrọ chakoo ugbua, n'ihi na ndị mmadụ gbara ọsọ maka ndị mwakpo ahụ ndị gbara ụfọdụ ụlọ ọkụ kwuru na ha ga-abịa ọzọ. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ SP Muhammad Shehu kwuru na akụkọ na mmadụ 30 nwụrụ na steeti ahụ n'ime mwakpo ahụ bụ okwu ụgha. Shehu kwuru na ọ bụ naani mmadụ atọ nwụrụ. Akụkọ ga-amasị gị: O kwukwara na ọ bụ imeobodo abụọ ka a wakporo. O kwuru na ndị uweojii menyụrụ ọkụ nsogbu ahụ n'obodo Danjoni ebe ha chụrụ ndị omekeome ahụ ụkwụ ete aja." afirika-53655643,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53655643,"Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ etinyela iwu ị kwesịrị ịhụ tupu i mee njem",Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu akpọrọ Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN) bụ Henrietta Yakubu kwuru na o nweghị ihe ngalaba ahụ ga-eme maka usoro ụlọọrụ ụgbọelu si ofesi hiwere maka ụmụ Naijiria na-aga mba ọzọ.,"Nke a na-eme dịka ụfọdụ ụloọru ụgbọelu dịka Emirates, Etihad, Kenya Airways na ndị ọzọ tinyere iwu nke kwuru na onye ọbụla sị Naijirịa chọrọ iso ụgbọelu ha mee njem ga-egosirịrị akwụkwọ nnyocha coronavirus nke gosiri na ha ebughị ọrịa ahụ tupu ha ekwe buru ya. Ha kwuru na akwụkwọ ahụ a ga-eme nnyocha ahụ n'ime abalị anọ tupu onye ahụ emee njem ya. Usoro ndị a gụnyere na onye ọbụla sị Naijirịa eme njem ụgbọelu a ga mba ọzọ ga-egosi ha akwụkwọ nyocha na-egosi na o bụghị ọrịa coronavirus. Nke a wepụrụ ohere ndị mmadụ nwere ịkwụ ụgwọ njem n'oge ka ọ beere ha ego, ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta mpụta nyocha ha n'oge . Yakubu kwuru sị ""Obodo niile nwere ikike ihiwe usoro nke ha maka nchekwa ọrịa coronavirus, o nweghị ihe ụlọọrụ FAAN ga-emewnu maka nke a"". O kwukara sị ""Ka mmadụ niile mee njem ofesi nanị mgbe ọ dị mkpa ma ka ha bido kwa n'oge haziwe ihe niile ha ga-eji eme njem a n'oge"". Dịka Naijirịa ebidobeghị njem ụgbọelu nke ofesi, Yakubu na-ekwu na ha na-etikọ isi ọnụ iji wepụta usoro njem ndị si ofesi chọrọ ịbata Naijirịa. Lee ụfọdụ ndi ụlọọrụ ụgbọelu hiwere usoro a: Emirates Etihad Kenya Airways Qatar Airways Cheta na e hinyeburu mmalite njem mba ofesi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst, tupu e bugharịa ya gaa ụbọchị ise nke ọnwa Septemba. 'Gọomentị Naịjirịa ga-amachị onye njem ụgbọelu mba ofesi ọbụla ghọrọ aghụghọ maka nnyocha COVID-19' - Sani Aliyu Dịka a na-akwado maka mmehe njem ụgbọelu mba ofesi ụbọchị Satọde na-abịanụ, onyeisioche ọrụ ọtawaike COVID-19 bụ Sani Aliyu adọọla aka na ntị na onye njem ọbụla ghọrọ aghụghọ maka nyocha nje coronavirus na gọọmentị Naịjirịa ga-amachi ya ịbata obodo a. O kwuru nke mgbe ndị otu ọtawaike COVID-19 akpọrọ Presidential Task Force on COVID-19 na agwa ndị nta akụkọ okwu ụnyaahụ. Aliyu kwuru bụ onye kwuru nke a n'Abụja ụbọchị Mọnde sị na ha ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị na-eme njem sị mba ofesi dịka Naịjirịa na-ejikere ịmehe njem ụgbọelu mba ofesi ọzọ ụbọchị Satụde. O kwuru na onye ọbụla na abata Naịjirịa ga-eme nnyocha ahụ Bekee kpọrọ ""Polymerase Chain Reaction test for COVID-19"" n'obodo ha si, wekwara mee ọzọ mgbe ha rutere Naịjirịa. Ọ sị na ndị dara ya bụ ule ahụ agaghị abata Naịjirịa. Ndị ụgbọelu ghọrọ aghụghọ maka ule ndị a ga-akwụ nha $3,500 maka otu onye njem dara iwu a. Ọ dọkwara ha aka na ntị maka onye njem ọbụla agaghị eme nnyocha hụ nke aga eme abali asaa onye ahụ batachara Naịjirịa. Aliyu sị ndị ọrụ Immigration ga-akagbu akwụkwọ ikike njem ya. O kwuru na ya bụ mpụtara nnyocha agaghịzị adị ire ruo abali iri na anọ (14), dịka akara mbụ, kama na ha emeela ya abali asaa malite ụbọchị ha mere ya, na agaghị akarị abali abụọ tupu ha amapụ ya bụ njem. O kwukwara na onye ọbụla ga-aga eme ya bụ nnyocha na Naịjirịa ga-akwụ ụgwọ ya malite na 29 ọnwa Ọgust 2020. Ọgọst 29: Njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị a Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ekwuola na njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst. O kwukwara na ọ bụ ọdọụgbọelu Legọs na Abuja ka njem a ga-ebu ụzọ malite. O kwukwara na ọ ga-ewepụta usoro nakwa iwu ndị pụrụiche ga-ekpuchi njem a n'oge adịghị anya. Mana akụkọ si n'akụkụ tebulu otu ""presidential task force"" na-ekwu na esubeghị oge mmepe njem ofesi kpọm." afirika-56700830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56700830,Ebonyi state news: Oke mmiri eburula ụlọ ma merụọ ndị mmadụ ahụ n'Ebonyi,Onye ndu obodo Nwezenyi nke dị n'Igbeagu nke Ebonyi steeti bụ Pius Ola si na oke mmiri zoro mebiri ụlọ 12 ma merụrụ ndị mmadu ahụ.,"Ọ bụ n'ụbọchị Tọọzde bu ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ ka mkpa mkpa a kpara. Maazị Ola na-arịọ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka. Otu onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ukochukwu ụka Anglican na Nwezenyi bụ Ifechukwu Ezeuko, sị na ọ bụ ka ọ kụrụ elekere asaa nke abalị ka oke ikuku bịara buru elu ụlọụka. Ọ sị na ọ bụ ụlọụka abụọ na ọtụtụ ụlọ n'obodo ahụ ka oke mmiri a mebiri. Ụlọụka mmiri mebiri Ukochukwu Ezeuko sị na ọtụtụ ezinaụlọ gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Odoziakụ Angela Owu, Igbenyi Francis, Veronica Agbo na ndi ọzọ kọkwara etu ọdachị a si metụta ezinaụlọ ha. Ụlọ mmadụ mmiri buru Ụlọụka Anglikan mmiri a mebiri" afirika-50408886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50408886,Africa's longest snake: Anyị gburu Eke ogba ọ bụghị Eke Idemmili - Ndị Oba,Ọ bụ eziokwu na ndị Idemmili dị n'Anambra steeti anaghị egbu eke kama ha na asọ ya asọ dịka omenala ha siri dị.,"E gbuola eke loro atụrụ abụọ n'Anambara steeti Mana ha gburu nnukwu eke dịka o lochara atụrụ abụọ dịka Nairaland siri gbaa n'ama. Onye isi Okpuno Oba town Union bụ Christian Igwilo gwara BBC na Eke ha gburu bụ ajọ Eke ogba nwere ike igbu mmadụ n'ihi ya osoghi na eke Idemmili na-asọpụrụ. Igwilo Kọwara na otu nwoke Onyeka Emole na achọ atụrụ ya abụọ n'obere ọhịa dị n'ihu ụlọ ya mgbe ọhụrụ ya bụ eke karịrị feet 15 ebe oloro atụrụ ya ma tọgbọrọ. Onyeka Emole gwara BBC na kemgbe nne ya jiri mụọ ya rute tata na anya ya ahụbeghị ụdịrị eke ahụ mbụ. Ọ kọwara ma ọ bụ nwunye ya bu ụzọ hụ eke ahụ mana ọ mataghị ihe ọ bụ. Ngwa ngwa ọ kpọrọ ya ka ọ chọpụtara na ọ bụ eke ọgba, nke a mere o jiri tikuo ndị obodo ka ha bịa gbatara ya ọsọ enyemaka. Onyeisi Okpuno Oba town union kọwara na ọ bụzị ndị nche Neighborhood watch gbakatara ya bụ eke ọgba egbe tupu ọ nwụọ. Mgbe ụmụ okorobịa Oba buzi ozu Eke ahụ gaa na junction Oba, ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ụgbọala gbakọrọ na agbara anya ha ekeresimesi. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50539523,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50539523,2019 Caf player of the year award: Aha ndị ga-azọ ọkaibe nke asọmpi Afrịka agbaala,"N'egwuregwu, Confederation of African Football ewepụtala aha ndị nwereike iso na nturu ugo ndị bụ ọkaibe n'egwu bọọlụ nke Afrịka na 2019.","Onye egwu Liverpool bụ Mo Salah ji nturuugo ọkaibe nke afọ 2018 Mmadụ atọ ụmụnwaanyị ndị Naịjirịa na otu nwoke sọ na ndị ana elegara anya maka ya bụ nturu ugo. N'ime aha 30 ewepụtara, mmadụ 10 si Premia Lig. Mohamed Salah nke Ijipt bụ onye tugooro ya bụ ụgọ ụgboro abụọ sokwa na ndị ahọpụtara ga-eso zọọ ya na ndị otu ya na Liverpool bụ Sadio Mane nke Senegal na Naby Keita nke Guinea. Ndị ọzọ bụ Riyad Mahrez bụ onye nyere Algeria aka bute iko Nations Cup nke 2019. Mahrez sọ na mmadụ atọ ndị Algeria ọzọ sọ azụ nturuugo a. Ndị ọzọ aha ha pụtara bụ Denis Onyango nke Uganda na-echere ndị Mamelodi Sundowns goolu. Achraf Hakimi nke Morocco sokwa ya na Victor Osimhen nke Naịjirịa. N'egwuregwu ụmụnwaanyị, asaa na ime iri ha so gbaa iko mbaụwa nke France 2019. Nigeria were mmadụ atọ na ya bụ akwụkwọ bụ nke Asisat Oshoala so n'ime ya, ya na ogbo ya nke Saụt Afrịka bụ Thembi Kgatlana. Ndị ama ama n'egwu bọolụ na ndị ntaakụkọ bụ ndị họpụtara ndị a maka ya bụ nturuugo a ga-eme na Tuzde Ọnwa nke mbụ n'afọ 2020 na Ijipt. Lee aha ndị pụtara Ndị okwe (Ụmụnwoke) Achraf Hakimi (Morocco & Borussia Dortmund) André Onana (Cameroon & Ajax) Baghdad Bounedjah (Algeria& Al-Sadd) Carolus Andriamatsinoro (Madagascar & Al Adalah) Denis Onyango (Uganda & Mamelodi Sundowns) Eric Maxim Choupo-Moting (Cameroon & Paris Saint-Germain) Ferjani Sassi(Tunisia & Zamalek) Hakim Ziyech (Morocco & Ajax) Idrissa Gueye (Senegal & Paris Saint-Germain) Ismail Bennacer (Algeria & AC Milan) Jordan Ayew (Ghana & Crystal Palace) Kalidou Koulibaly (Senegal & Napoli) Kodjo Fo Doh Laba (Togo & Al Ain) Mahmoud Hassan""Trezeguet"" (Egypt & Aston Villa) Mbwana Samatta (Tanzania & Genk) Mohamed Salah (Egypt & Liverpool) Moussa Marega (Mali & Porto) Naby Keita (Guinea & Liverpool) Nicolas Pepe (Ivory Coast & Arsenal) Odion Ighalo (Nigeria & Shanghai Shenhua) Percy Tau (South Africa & Club Brugge) Pierre-Emerick Aubameyang (Gabon & Arsenal) Riyad Mahrez (Algeria & Manchester City) Sadio Mane (Senegal & Liverpool) Taha Yassine Khenissi (Tunisia & Esperance) Thomas Partey (Ghana & Atlético Madrid) Victor Osimhen (Nigeria & Lille) Wilfred Ndidi (Nigeria & Leicester City) Wilfried Zaha (Ivory Coast & Crystal Palace) Youcef Belaili (Algeria & Ahli Jeddah) African Women's Player of the Year Ajara Nchout (Cameroon & Valerenga ) Ange N'Guessan (Ivory Coast & Tenerife) Asisat Oshoala (Nigeria & Barcelona) Chiamaka Nnadozie (Nigeria & Rivers Angels) Elizabeth Addo (Ghana & Jiangsu Suning) Gabrielle Ouguene (Cameroon & CSKA Moscow) Refiloe Jane (South Africa & AC Milan) Tabitha Chawinga (Malawi & Jiangsu Suning) Thembi Kgatlana (South Africa & Beijing Phoenix FC) Uchenna Kanu (Nigeria & Southeastern Fire) Ndị na-agba n'Afrịka Ali Maaloul (Tunisia & Al Ahly) Anice Badri (Tunisia & Esperance) Denis Onyango (Uganda & Mamelodi Sundowns) Emmanuel Okwi (Uganda & Simba) Ferjani Sassi (Tunisia & Zamalek) Fousseny Coulibaly (Ivory Coast & Esperance) Franck Kom (Cameroon & Esperance) Herenilson (Angola & Petro de Luanda) Ismail El Haddad (Morocco & Wydad Casablanca) Jean Marc Makusu (DR Congo & AS VITA) Kodjo Fo Doh Laba (Togo & RS Berkane / Al Ain) Mahmoud Alaa (Egypt & Zamalek) Meddie Kagere (Rwanda & Simba) Meschack Elia (DR Congo & TP Mazembe) Taha Yassine Khenissi (Tunisia & Esperance) Tarek Hamed (Egypt & Zamalek) Themba Zwane (South Africa & Mamelodi Sundowns) Trésor Mputu (DR Congo & TP Mazembe) Walid El Karti (Morocco & Wydad Casablanca) Youcef Belaïli (Algeria & Esperance / Ahli Jeddah) African Youth Player of the Year Achraf Hakimi (Morocco & Borussia Dortmund) Amadou Haidara (Mali & RB Leipzig) Amadou Sagna (Senegal & Club Brugge) Enock Mwepu (Zambia & Red Bull Salzburg) Ismaïla Sarr (Senegal & Watford) Krépin Diatta (Senegal & Club Brugge) Moussa Djenepo (Mali & Southampton) Moussa Ndiaye (Senegal & Excellence Foot) Musa Barrow (Gambia & Atalanta) Osvaldo Pedro Capemba 'Capita' (Angola & Primeiro de Agosto) Patson Daka (Zambia & Red Bull Salzburg) Samuel Chukwueze (Nigeria & Villarreal) Sekou Koita (Mali & Red Bull Salzburg) Steve Regis Mvoue (Cameroon & AS Azur Star) Victor Osimhen (Nigeria & Lille) Zito Luvumbo (Angola & Primeiro de Agosto) Ndị nkuzi ụmụnwoke Aliou Cisse (Senegal - Senegal) Christian Gross (Switzerland - Zamalek) Corentin Martins (France - Mauritania) Djamel Belmadi (Algeria - Algeria) Faouzi Benzarti (Tunisia - Wydad Athletic Club) Gernot Rohr (Germany - Nigeria) Moïne Chaâbani (Tunisia - Esperance) Mounir Jaouani (Morocco - Berkane FC) Nicolas Dupuis (France - Madagascar) Pitso Mosimane (South Africa - Mamelodi Sundowns) Ndị kuzi ụmụnwaanyị Alain Djeumfa (Cameroon) Bruce Mwape (Zambia) Clementine Toure (Ivory Coast) Desiree Ellis (South Africa) David Ouma (Kenya) Thomas Dennerby (Nigeria) Ụmụnwoke sị mba dị iche iche Algeria Madagascar Nigeria Senegal Tunisia Ụmụnwaanyị aha ha pụtara Cameroon Ivory Coast Kenya Nigeria South Africa Zambia Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47655234,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47655234,Deji: Charlie Boy bụ meremere n'ihu gwọpịtị n'azụ,Charles Oputa bụ otiegwu a ma-ama dịka 'Charly Boy' akọwala etu mmiri si banye opi ụgbọghọrọ n'ebubo e boro ya na ọ naara ndị ọchịchị Buhari ego iji katọọ Atiku Abubakar.,"'Ego APC nyere m bụ ego ihe onyonyo m mere ha, ọ bụghị akaazụ' Onye na-alụ ọgụ maka ikike ruru onye a kpọrọ Deji Adeyanju ma bụrụ onye ya na Charly Boy jirikọrọ aka hiwe 'Our Mumu Don DO' boro Charly Boy ebubo ị nara gọọmenti etiti ego oge a tụnyere ya na mkpọrọ iji katọọ Atiku Abubakar ma kwụsịkwa ịkatọ Buhari. End of Twitter post, 1 Adeyanju kwuru na oge ya jụrụ Charly Boy nke bụ eziokwu, na Charly Boy n'ezie na ha nyere ya ego ma ego ahụ abụghị iji megide Atiku kama na ọ bụ ego ha nyere ya iji na-akwado ya bụ Charly Boy. Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na Charly Boy nwere Oputa kwuru na ya ma ihe na-eri Deji Adeyanju nri n'afọ na ọ bụghị ebubo ọ na-ebo ya. Oputa kwuru na n'ezie na Festus Keyamo bụ ọkaiwu APC nyere ya ego mana ego ahụ bụ ego ọrụ ọ rụrụ ha dịka onye na-emepụta ihe onyonyo. ""Ana m arụ ihe dị iche iche, ihe onyonyo, 'documentary'. Ihe niile m na-eme nwere akụkụ achụmtaego. ""E mechara m ihe onyonyo 'Park n Go,' ha na-asị na m naara ndị PDP ego, na ọzọ akpọrọ 'Another guy man wan enter' ha asị kwa na m nara ego. ""Agwaala m ndị mmadụ na APC na PDP o nweghị nke nwere isi. Ya mere m ji gwa ndị otu Sowore ka ha jịkọta ọnụ hazie 'Third Force."" ""Ihe butere okwu bụ na m chọtala ndị ọrụ NGO doro anya dịka onye ọ bụ kemgbe ha ji bata ka ọdịzị a ka ụgbọ na-achọ ịgha ha."" Mgbe BBC jụtara ọnụ Adeyanju, O kwuru na ""Ihe Charly Boy mere tụrụ m n'anya."" n'ihi na ọ wụrụ ya n'ala. ""Agaghị m ata ndị mmadụ na-agbagha Naijirịa aga mba ofesi ụta."" ""Ka m tinye uchu na inwetakwa onwe m ọzọ."" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47925000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47925000,Ajegunle Killing: Ndị uweojii agbagbuola onye ọzọ na Lagos,Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Bala Elkana sị na aka akparala ndị uweojii a na-eche n'aka dị n'ogbugbu nwa agbọghọbịa n'Ajegunle dị na Legọs.,"Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme N'akwụkwọ mgbasa ọzị o binyere aka, Elkana sị na onyeisi ndi uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu nyere iwu ka anwụchịkọ ndi uweojii aka ha dị na mgbagbu mmadụ metụtara Ada Ifeanyị di afọ iri abụọ nakwa Emmanuel Akomafuwa. Ndi uweojii si na ihe mere n'utụtụ Satọde bu ụbọchi nke iri an ato nke ọnwa Epreelu, n'ebe elekere asaa. Akwụkwọ mgasa ozi a sị: ""Eburu ndị a ihe metụtara gawa ụlọ ọgwụ ebe ekpebiri na Ada Ifeanyi anwụọla. Emmanuel Ifeanyi no ebe ahụ anata ọgwụgọ."" Ndi uweojii aka ji bụ: Inspector Adamu Usman, Sergeant Adeyeye Adeoye, Sergeant Kashim Tijani, Sergeant Lucky Akigbe na Sergeant Paul Adeoye. Inspector Dania Ojo, bu onye gbapụrụ ọsọ mgbe ihe a mere bụ onye a na-achọzị achọ."" Cheta na akụkọ na soshal midikọwara etu ndị uweojii ji gbabuo nwa agbọghobịa ma merụrụọ nwoke ya na ya so ezigbote ahụ n'abalị ụnyaahụ. Onye ọnu na-eru n'okwu n'ihe banyere mmegide ndị uweojii eji akara Twitter @segalink mara dere na ndị uweojii anwụchiela ndi otu ha kpara ike a. Nke a na-abịa dika onye oti egwu aha ya bụ Rugged Man tiri mkpu sị ka ekpee onye ọbụla gburu onye aka ya di ọcha ikpe ọnwụ. Rugged Man dere ihe a n'akara Twitter bụ @RuggeddyBaba Oke ogbugbu ndị mmadụ site na aka ndị uweojii bụ ihe ọtụtụ mmadu na-akatọ. Na nsonso a, ha gbagburu nwoke aha ya bụ Kolade Johnson na otu Legọs a kwa, nke mere ụtụtụ mmaọ̄ụ jiri kwalitekwa atụmatụ #EndSARS. Lee ihe otu onye dabanyere n'aka ndị SARS gwara BBC Igbo. Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya." afirika-47437853,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47437853,Lagos Election: Ntuliaka 2019 ọ na-akpalite ịkpa oke agbụrụ?,Ntuliaka e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị kpalitere okwu agbụrụ na Legọs.,"Kemgbe ọgbaghara metụtara ndị Igbo bi na Okota na Aguda dapụtara na ntuliaka ọkwa onyeisiala ahụ, ụfọdụ mmadụ ekwuola okwu megide ndị Igbo na Legọs. N'afọ 2015, Ọba Legọs bụ Rilwan Akiolu, gwara ndị Igbo na a ga-atụnye ha n'oke osimiri ma ọ bụrụ na ha atụnyereghi onye ọ na-akwado na ntuliaka ahụ. Mgbe Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru PDP mgbe ahu malitere ịchụ nta vootu nke 2019 a, ọ bulitere akụkọ ahụ n'ụdị ụfọdụ mmadụ si na ọ bụ iji kpalite iwe ndị mmadu kefụrụ. Ụdịrị ihe ahụ welitere isi ọzọ na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2019, mgbe ụfọdụ ndị Igbo kwuru na e gbochiri ha ịtụ vootu gwa ha ""laghachi n'ala Igbo"" gaa tụọ vootu. Onye ọzọ kwuru ka ndị Igbo kwụsị itinye ọnụ n'okwu ndọrọndọrọ n'obodo ndị ọzọ na-abụghị mpaghara ọwụwa-anyanwụ. N'ụbọchị Monde so ụbọchị ahụ, ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'ala Igbo gwara BBC Igbo na ndị agboro bịara kwapịa ọdọahịa ha. Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere Ihe ndị a kpalitere okwu ""Onye nwe Legọs?"", n'etiti ndị Igbo na ndị Yoroba, ọkachasị n'elu soshal midia. Mana e nwere ndị na-akwado ndị Igbo, na-ekwu sị kwụsị ikpaso ha oke. @Olushola_shola kwuru sị na ndị Igbo sokwa nwee ọnụ n'ime ala ndị Yoroba. @Bombay_005 kwuru sị na nwunye ya bụ onye Igbo, na o soghi na-asị ndị igbo ""kwapụ-kwapụ"". @KAdebakin kwuru sị na ndị Igbo ebiela n'ala ndị Yoroba ihe karịrị afọ narị. @omotourlar kwuru na ọ bụ ndị Igbo na-eweta ọkụ n'ala ha. @bolanle_cole kwuru na ndị Igbo bụ ezigbo uru nye ndị mpaghara ọdịda-anyanwụ. Ka okwu a na-aga n'ihu, ụfọdụ ụmụafọ Igbo tinyere ọnụ wee na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na ndị Yoruba na akpasị ndị Igbo oke agbụrụ na Legọs." 46337005,https://www.bbc.com/igbo/46337005,Rita Dominic: Gịnị mere aha ya ji ewu na soshal midia?,"Ọ bụrụ na i chere na ọ bụ ihe gbasara ihe nkiri ka aha Rita Dominic ji ewu na soshal midia ugbua, ị mara na i yi azụ akwa.","Nwaada na-eme ihe nkiri danyere na nsogbu dịka ndị ihe ya na-amasị bidoro na-akpọ ekwentị ya aghara aghara. Ebee ka ha siri nweta akara ekwentị ya? Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị ji ịntanet akpa ajọ agwa zubara n'akara Nina nke soro na BBnaija were gbasa ozi akara ekwentị Dominic nyere ya. End of Twitter post, 1 Cheta na nsonso a, BBC Igbo gwara gị ihe i kwesịghị ime na soshal midia, mana ugbua otu n'ime ha atụọla Nina na ndị enyi ya mbọ n'ike. Ugbua, ụwa niile ejirila obere ọdachi a eme ihe ịkpa ọchị na soshal midia. Lee ihe ụfọdụ na-ekwu maka ya: @_Feloya kwuru na ya kpọrọ akara ekwentị Dominic, ọ bụrụ na ọ gbanyụọla ya. @Chinwekzy kwuru na ihe Dominic na-amasị ya kemgbe ọ dị na nwata. @iamoscarisrael gosiri obi mwute na ụmụ Naijiria ji ihe mere Dominic mere ihe ọchị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45669751,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45669751,Ihe ise ị na-amaghị maka George H W Bush nke nnukwu,Aka chiburu mba America anwụọla bụ George Herbert Walker Bush anwụọla n'afọ iri itoolu na anọ .,"George H W Bush chịrị Amerịka afọ anọ(1989-1993) Ọ bụ nwa ya nwoke George W Bush kwuputere nke a . George Bush Sr, dịka aha eji mara ya nwụrụ n'ụbọchị Nọvemba 30 n'elekere iri nke abalị dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị be ha si kwu. Bush chịrị Amerịka site n'afọ 1989 ruo afọ 1993 ma chịkwa ugboro abụọ dịka osote onyeisiala Amerịka bụ Ronald Reagan. N'ọnwa Aprelụ, akpọgara ya ụlọ ọgwụ maka ọrịa metụtara ọbara ya mana o mechara nwete ọgwụgwọ laghachi bee ya. Bush onye bụ onyeisiala mba Amerịka nke iri anọ n'otu nwụrụ ka ọ gafechara ọnwa asaa nwunye ya Barbara ji nwụ. Ihe ndị ọzọ eji mara Bush nnukwu bụ : Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ndụ o biri. Onye na-achị mba America ugbua bụ Donald Trump etoola ndụ Bush nnukwu biri kwuo na ọ na-eme mma karịa etu esi tụanya mgbe ọ dị ndụ. Bill Clinton so kwa chị Amerịka n'oge gara aga kwukwara na ya ga-enwere ọyị ya Bush nnukwu dịka ihe nrite ọkachasị nweta na ndụ ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51592336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51592336,"Nigerian Pastors: ""A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ"" na okwu ndị ọzọ e ji mara ndị ụkọchukwu",Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na Naịjirịa na-ekwu okwu na-eme ka ebe niile nwuru ọkụ.,"Mana ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e ji okwu dị aṅaa mara, nke bụ na ebe ọbụla ị nọ nụ olu ha nakwa okwu ha, ị mara onye kwuru ya. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu bụ ndị malitere iwu ewu n'ihi ihe ha kwuru, ebe ndị ọzọ na-ekwu ihe ha na-ekwu iji mee ka ndị mmadụ jiri ya mara ha nke Bekee kpọrọ Trademark. Lee okwu e ji mara ụkọchukwu ndị a: 1) Enoch A. Adeboye: Nwanne ị bụzịkwa onye Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị maghị onye na-ekwu ""Let somebody shout Hallelujah"" ka ọ bụzị ""Say that amen louder""? Adeboye rigohaala n'elu ọlta, otu n'ime ihe mbụ ọ na-ekwukwarị bụ ka ndị mmadụ tie mkpu Hallelujah; nke a emeela ka onye ọbụla mara na ọ bụ ya na-ekwu okwu. Adeboye bụ onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God nke a na-akpọ RCCG n'ịchafụ. 2) David Oyedepo: Ị ga-ama na ị nọ na Winners Chapel mgbe ị nụrụ ""Good news! The Lord has done it again"". Ọ na-ekwukwarị nke a ma e nwee nkwuputa ọkachasị nke gbasara ihe iribeama. Oyedepo bụ onyeisi Living Faith Church nke e ji Winners Chapel mara. 3) Temitope B Joshua (T.B Joshua): Ị chọrọ ịma ma ọ bụkwa olu ya ka ị na-anụ, tinye ihe onyonyo gị n'ebe a kpọrọ Emmanuel TV. Ebe ahụ ka ị ga-ama ma ọ bụ T.B Joshua na-ekwu okwu mgbe ị ga-anụ ""touch your screen"" nakwa ""Emmanuel""! Onye amụma Joshua bụ onyeisi ụlọụka Synagogue Church Of All Nations. 4) Chukwuemeka Ohanaemere: Ị bụrụ nwaafọ Naịjirịa ọkachasị onye Igbo, ị gaara anụla maka onye a na-akpọ Odumejeje maọbụ ""Liquid Metal"", ""The Lion Himself"". Ohanaemere ekwuola ọtụtụ ihe e ji echeta ya; gụnyere ""Onye battery ya fọrọ one bar ọ na-agba game?"", ""Anaghị akpọ ọga n'express"", ""Onye gba ọtọ a na-etinye aka n'akpa?"", ""A na-ahụ ọka na filling station?"" nakwa ""A kpaa gị ị pụọ n'ụzọ ka a kpaa onye ọzọ"". Ọ bụ onyeisi ụka Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry. 5) Ejike Mbaka: Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" Fada Mbaka ekwuola ọtụtụ okwu mụnyere ọkụ ma kpalite ndọrịtaụka n'etiti ndị Naijiria ọtụtụ oge. Mana ndị nke kacha bụrụ njirimara ya ọ ga-abụ ị nụ ya ị mara na ị garuola ebe ọ nọ bụ ""Tem tem for Jesus"", ""Ụmụ ikuku eh"" nakwa ""Onye eze ibe m"". Mbaka bụ onyeisi Adoration Ministries dị n'Enugwu steeti. 6) Chris Oyakhilome: Oyakhilome so na ndị ụkọchukwu ụlọụka ha dị na mpaghara ụwa dị iche iche. Okwu e ji mara ya gụnyere ""So mightily grew the word of God and prevailed"", Ọ bụ onyeisi ụlọụka Believers' Loveworld nke e ji Christ Embassy mara. 7) David Ogbueli: Ogbueli so na ụkọchukwu ndị anaghị ""enyekarị nsogbu"" na Naịjirịa, mana o so na ndị ụlọụka ha buru ibu ma dịrị na mpaghara Naịjirịa dị iche iche. Okwu ndị e ji mara ya gụnyere ""Let them have dominion"", ""how do you create someting out of nothing"" nakwa ""God's principles never change"". Ọ bụ onyeisi ụlọụka Dominion City Worldwide. Kedụ nke ụkọchukwu ụlọụka gị na-ekwukarị? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'" afirika-51225156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51225156,China Coronavirus: Anyị ebidola inyocha ndị njem - FAAN,Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria bụ 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN) arịọla ụmụ Naijiria na-eme njem ka ha rube isi ma nye ohere maka inyocha ha ahụ.,"FAAN na-eme nyocha ahụ iji wee hụ na ha gbochiri ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa Nke a na-eme dịka ajọ ọrịa Coronarvirus dapụtara na China, gbuo mmadụ iri abụọ na ise ma jituo ihe karịrị mmadụ 300. Ọrịa ahụ efesakwaala ruo mba Japan,Thailand, Singapore nakwa South Korea. N'akwụkwọ ozi ya, ọnụ na-ekwuru FAAN bụ Henrietta Yakubu kwuru na ụlọrụ ahụ na ngalaba na-ahụ maka ahụike agbaala mbọ iji hụ na ngwa ọrụ dị mkpa iji gbochie ọrịa ahụ zuru oke n'ọdọụgbọelu. O kwuru sị: ""Ngwa ọrụ nile na ndị ọrụ ndị nyere aka na ịkwụsị ọrịa ebola n'afọ 2014 ka dịkwa n'ọdọụgbọelụ anyị."" Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirụs emeela ka e mechie obodo mepere emepe atọ na China; Wuhan, Ezhou na Huanggang . Obodo Beijing kwụsịkwara mmemme niile ha chọpuburu ime n'ihi ya bụ ọrịa. 'Lassa Fever' ka na-akpa ike Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti. Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti. ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti. Mmachị obodo Wuhan nke dị na China Nje Corona egbuola mmadụ iri na asaa na mba China Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS. Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan. Ọkụ Ọstrelịa Ọkụ a egbuola otutu mmadụ ma mebie kwa ihe Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa. Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019. Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa. FAAN na-eme nyocha ahụ iji wee hụ na ha gbochiri ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa" afirika-52798583,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52798583,Onye bụbụ onyeisi Imo Broadcasting Corporation ewerela mma sụgbuo nwunye ya,"Ihe na-ajụ obi oyi mere n'ụbọchị Satọde, ụbọchị 23 nke ọnwa Mee, n'obodo Imerienwe dị n'Imo steeti, dịka onye bụbụ onyeisi ụlọọrụ Imo Broadcasting Corporation (IBC) gburu nwunye ya na be ha.","Otu onye obodo ahụ gwara BBC na amatabeghi etu ihe a jiri mee, karịa na ọ bụ nwoke ahụ a na-eche na ọ dị afọ iri asatọ na abụọ gburu nwunye ya ruru afọ iri asatọ. Nchọpụta BBC bụkwa na ndị a ebiela dịka di na nwunye ihe gafere afọ iri ise, tupu ihe a emee. Godson Orlando Ikeokwu bu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo, kwuru na ihe a mere n'eziokwu ma sịkwa na ha ga-amalite nchọpụta isi na ọdụ ihe a mere. Onye ọzọ si Imerienwe gwara BBC na ihe a mere gbara obodo ahụ niile gharị, makana nwoke ahụ bụ onye ama dịka onye aka ya kwụ ọtọ ma bụrụkwa onye na-eme nwayọ nwayọ. ""Mmadụ niile na-eru uju ugbua. Nwoke a bụ onye umeala anyị na-akpọ Nna anyị Ukwu."" Onye a gwakwara BBC na nwa TC Okere bịara kpọrọ ya pụọ n'obodo ahụ, ma sịkwa na ọ bụ ka e bu nwaanyị ahụ aga ụlọọgwụ dịka a sụchara ya mma ahụ, ka ọ nwụrụ. Maazị Ikeokwu na onwe ya gwara BBC na ha ejidela nwoke ahụ, ma kpọrọ gawa ụlọ ọrụ ha. Ọ sịkwa na afọ ole Maazi Okere dị bụ iri asatọ na abụọ n'eziokwu." egwuregwu-44359637,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44359637,French Open: Serena Williams apụọla,Ụlọ ntaakụkọ AP na-ekwu ugbua na agbara ewguregwu Tennis bụ Serena Williams apụọla na French Open.,"Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa Ha kwuru Williams pụrụ na-egwurewgu ka ọ pụtara na o nwere asọmpị ya na Maria Sharapova ka ga-agba. Lee ebe ndị AP gbasara akụkọ a n'elu akara soshal midia Twitter ha: End of Twitter post, 1 Serena dị afọ ịrị atọ n'isii gwara ndị ntaakụkọ n'obodo Roland-Garros nke mba France taa n'ọbụ n'ihi ahụ ọ merụrụ n'obi ka o ji pụọ n'asọmpị ahụ. Serena na Maria Sharapova na-akwado ịgba asọmpị agba nke anọ taa bụ Mọnde. Lee ihe BBC Sport dere na Serena kwuru: Nke na-egosi na ọ bụ maka ezinaulo ha ka o jiri rapụ asọmpị a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53722831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53722831,Azubuike Ekwegbalu: 'Ndị ọjọọ gbara na be nwanne m magbuo ya' - Chief Ekwegbalu,Akụkọ BBC Igbo nwetere n'ụtụtụ Monde bụ na ndị ekperima amabeghi ndị ha bụ gara na be Azubuike Ekwegbalu n'elekere mbụ nke isi ụtụtụ were mma magbuo ya.,"Azubuike Ekwegbalu bụ onye enyemaka pụrụiche nke Gọvanọ Willie Obiano nke Anambra steeti, n'okwu gbasara nchekwa. BBC Igbo kpọtụụrụ nwanne ya nwoke bụ Ikechukwu Ekwegbalu bụkwa onyeisi ndị ahịa n'Anambra steeti niile gbaa gburugburu. O kwuru na ndị uweojii Anambra steeti ka na-eme nnyocha gbasara ọnwụ nwaamadị ahụ. Ọ bụ mgbe ha mechere ya bụ nnyocha ka ha ga-amata nke bụ eziokwu. Nwa Chief Ekwegbalu bụ Nnamdi Ekwegbalu kwuru na ọnwụ nwanne nna ya dara ha na mberede maka na ọtụtụ ndị ezinaụla ha tụkwasara ya obi. Gee olu nwa nwanne Azubuike Ekwegbalu Azubuike Ekwegbalu: 'Ndị ọjọọ gbara na be nwaanne m magbuo ya' - Chief Ekwegbalu Ọ kọwara ka ndị ajọ mmadụ a siri bata n'ụlọ ya gbuo ya. Azubuike ji nwaanyị na ụmụ atọ tupu ọ hapụ ụwa. Nnamdị kwukwara na o nweghị mgbe a tụrụ anya na ụdị ihe a ga-eme mana nke bụ eziokwu bụ na ọrụ Azubuike dịka onye ọrụ nchekwa nwereike ibute ajọ echiche maka ndị ajọ mmadụ na-eche na ọ na-anọchiri ha ụzọ. O kwukwara na ndị uweojii ka na-etinye anya na ya bụ okwu ma sịkwa na ha nwere olileanya na ha ga-ejide ndị mere ihe a ma kpụpụ ha ụlọikpe. New Anambra Burial Laws: Ihe 10 dara ụda n'iwu akwamozu ndị steeti a Akụkọ ga-amasị gị" afirika-56609973,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56609973,"Don Jazzy Married: A lụrụ m nwaanyị mgbe m dị afọ 20, mana anyị gbasara oge m dị 22",Oti egwu Michael Collins Ajereh a ma dịka Don Jazzy ekwuputela etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ ka na-amalite okorobịa.,"Don Jazzy dị afọ 38 ugbua kọwara etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ dị naanị afọ 20, mana ha gbasara ka naanị afọ abụọ gachara. O wepụtara foto agbamakwụkwọ ya n'elu Instagram ya iji saa ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị ya gbasara mgbe ọ ga-alụ nwaanyị. End of Instagram post, 1 O kwuru na ha malitere inwe okwu n'alụmdinanwunye ha maka na ọ bịara buru ihe gbasara iti egwu n'isi ya. O kwuru na ọ ka bukwu ihe gbasara mmepụta egwu ya n'isi, nke bụ na ọ na-atụ ụjọ na ọ ka nwere ike ịghasa alụmdinanwunye ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ. O kwuru na ọ ga-eji nwayọ nwayọ na-eme ihe gbasara ime ọyị nakwa ịlụ nwaanyị. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka alụmdinanwunye Don Jazzy: Omoissy kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n'anya na Dbanj na Wande Coal ekwuputaghi maka ya n'agbanyeghi esemokwu ha nweburu butere mgbasa ha. Dayo Ashiru kwuru na enweghi onye Don Jazzy ji ụgwọ nkọwa ihe gbasara ndụ ya." afirika-44977954,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44977954,Akwụkwọ njem afọ iri ekpuchighi onye ọbụla - Ngalaba na-ahazi njem,"Ọ bụ n'afọ 2016 ka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata nke a kpọrọ Nigerian Immigration Service na Bekee bụ Muhammad Babandede kwuru na ha chọrọ imegharị usoro e ji eme akwụkwọ e ji ama onye, nke a kpọrọ Passport n'asụsu Bekee.","Akwụkwọ njem afọ iri ekpuchighi onye ọbụla - Ngalaba na-ahazi njem Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere na Babanded sị, ""anyị enyela onyeisiala akwụkwọ ma na-enwe olileanya na ọ ga-aza anyị nso nso."" Nso nso ahu bụzị afọ abụọ, dika onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado ka e megharịa ihu akwụkwọ e ji amata ụmụ Naịjirịa, afo a mere ya afo iri Naịjirịa mepụtara akwụkwọ a n'usoro a kpọrọ e-passport na Bekee. Mmegharị a metụkwara afọ ole yabụ akwụkwo ga-adị ire. Ugbua ọ ga-adị ire ruo afọ iri, nke pụtara na e tinyere afọ ise n'afo ole ọ na-adịbu na mbụ. Ndi na-aga njem ọfụma so na ndị ga-erite uru kachasịa na atumatu ọhụru a Babandede sị na ihe a mere so na nhaziagharị Buhari nyere ha ikike ime, nke ga-enye akwụkwọ a nchekwa tọrọ atọ. ""Ka afọ iri e mepụtara akwukwọ a gara, anyị kwesiri ihaziagharị ya, mana nke bu nnukwu ozi bụ na akwụkwọ a ga na-adị ire ruo afọ iri,"" Babandede kwuru. Babandede kwukwara na ego a na-akwụ n'isi akwụkwọ a ga-arị, mana ọ siri na uru ga adị ya. Onyeisi ụlọọrụ ọpụpụ na mbata dị n'Ikoyi nke di na Legọs kọwara na ọ bụghị mmadu niile ka akwụkwọ ọhụru a ga-eru aka. O kwuru na ọ bụ ndị ruru afọ iri na asatọ ka erere a ga erute aka. Ya bụ na ọ bu maka ndị gọọmentị che na ha bu okenye. Gee ya ntị ọfụma na ihe onyonyo dị n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48810710,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48810710,Baby India: Ọtụtụ ezinaụlọ egosila mmasị ikuchi nwatakịrị nne ya mụrụ tufuo,Ọtụtụ ezinaụlọ n'akụkụ ụwa niile kwụ na ọgbara na-eche ka ha kuchie nwatakịrị nwaanyị ndị uweojii mba Amerịka kwuru na ha chọtara ya ebe atufuru ya atufu na mpaghara Georgia.,"The girl now known as ""Baby India"" was found after nearby residents heard cries Ndị uweojii kọwara na ọ bụ ndị bi n'okirkiri ebe ahụ nụrụ ka nwata ahụ na-ebe akwa ha wee kpọọ ha ka ha bịa kuru ya. A gụrụ nwata ahụ 'Baby India'. Ha kuuru nwata ahụ gaa ụlọọgwụ mana ndị dokịnta kwuru na ahụ siri ya ike. Ka izu atọ gachara, akụkọ kwuru na 'Baby India' ka gbasiri ike na-amụrị amụ n'ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka ebe edotere ya. Ọ ga-anọgide ebe ahụ wee ruo mgbe a ga-ahọpụta ndị ga-azuwazi ya dika nne na nna ya. Onyeisi ndị uweojii nke ime obodo Forsyth aha ya bụ Ron Freeman kwuru na a matabeghi onye bụ nne nwata ahụ maọbụ ndị agbataobi ya. Onyeisi ndị uweojii nke ime obodo Forsyth kwuru na ọ bụ site na amara Chineke na ahụ siri 'India' ike mgbe a chọtara ya. N'akara Facebook ha, ndị ọchịchị Forsyth kwuru na ha enweghi ozi ohụrụ ọzọ ha ga-ezi gbasara 'Baby India'. Mana Tom Rawlings bụ onye isi ""Georgia Division of Family and Children Services"" kwuru na ọtụtụ ezinaụlọ egosila mmasị ikuchi nwata ahụ. Rawlings kwuru nke a n'ihe onyonyo ndị ABC TV akpọrọ ""Good Morning America Show"". Area pipo call police afta dem hear di pikin dey cry Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ nnukwu ọrụ ebube na nwata ahụ ka dị ndụ mgbe ndị mmadụ hụrụ ya tupu ha akpọọ ndị uwe ojii. Mgbe achọtara 'Baby India' n'ime obodo Forsyth nke di na mpaghara ugwu Atlanta, Georgia, eriri otubo ya ka di ya n'ahụ nke gosiri na omebeghi elekere olemole amụpụtara ya. Lee akukọ nwaanyi mụrụ ejima anọ Akụkọ ga amasị gi:" afirika-47993149,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47993149,Education system: Ihe mere ndị ntoroọbịa ji agbahapụ agụmaakwụkwọ na Naịjirịa,Ministrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa kwuru na ihe ruru mmadụ nde iri isii agụghị akwụkwọ na Naịjirịa karịsịa ndị ntoroọbịa na ndị okenye.,"Nke a mere anyị ji na-ajụ kedụ ihe kpatara o jiri dị etu a? N'ajụjụ BBC Igbo jụrụ onye nkuzi na Mahadum Ebonyi Steeti bụ Nkechi Emma-Echiegu, ọ rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe na kpata nke a. Nke gụnyere; O kwuru na ọtụtụ ndị ntoroọbịa bịa tụle ụdị ego ndị nọ n’ọchịchị na-ebute nke ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ nkeọma anaghị enwete na-eme ka ha gbahapụ agụmaakwụkwọ ma chọwa ego mbute. Nkechi kwuru na ụfọdụ oge ọtụtụ ụmụakwụkwọ maara ihe ekwe na-akụ enweghi ndị na-akwado ha n’ịkwụ ụgwọ akwụkwọ, ịzụ akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ. Nke a na-eme ka ha gbahapụ agụmaakwụkwọ ma chọwa ihe ọzọ. O kwuru na ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-achọzi ụzọ ha ga-eji bute ego ọsọsọ ma hapụ ịgụ akwụkwọ. Ha na-ahụta ị ga n'ụlọakwụkwọ ihe ruru afọ anọ, ise ma ọ bụ karịa dịka igbu oge. O kwuru na ọtụtụ ha na-etinya aka na mpụ na ịgwọ ọgwụ ego dị iche iche nke gụnyere igbu mmadụ maka na ha hụrụ ka ụfọdụ ndị okenye mere ya ma ọ dabara ha. O kwuru na ọtụtụ omenala na nkwenye ụfọdụ ndị mmadụ bụ na ụmụnwaanyị ekwesighi ịgụ akwụkwọ na ọ bụ naanị ụmụnwoke. Nke mere na ogogo agụmaakwụkwọ n’etiti ụmụagbọghọbịa ji adị ala. Gịnị bụ ụzọ mgbapụta? Nkechi Emma-Echiegu kwuru na iji hụ na ogogo agụmaakwụkwọ n’etiti ndị ntoroọbịa gbagoro elu na Naịjirịa bụ ọrụ dịrị ndị gọọmentị, nne na nna nakwa ndị ntoroọbịa. Gọọmentị kwesiri inye ezigbo nkwado na ọzụzụ dị icheiche, belata ọnụ ego ụlọakwụkwọ ma nyekwa ohere agụmaakwụkwọ n’efu. Nne na nne ga-agba mbọ nye ụmụaka ezigbo ọzụzụ na ohere ka ha mụọ ma ọ bụ gụọ ihe masịrị ha karịa ịmagide ha ịgụ ngalaba akwụkwọ ọbụla. Ndị ntoroọbịa iwedata isi n’ala gụọ akwụkwọ ma hapụ ịchọ ego mbụte. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44144615,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44144615,Uwe anyị na-eyi agba nkwu,Ịlụ di maọbụ nwaanyị bụ ezigbo njem na ndụ mmadụ. Ọ bụ ihe mmadụ ole n'ole chọrọ ijide aka tupu ha ahapụ ụwa.,"Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu N'ala Igbo, nwoke gara ịlụ nwaanyị ga-amara na ọ bụghị sọọsọ nwunye ya ka ọ na-alụ. Ọ na-alụkwa ndị be ya niile. N'otu aka ahụ, nwaanyị na-alụ di na-alụkwa ndị be ya. N'ihi nke a, onye ọbụla siri n'ezinụlọ ha abụọ na-etinyekọta aka ịhụ na mmemme gbasara ndị a na-achọ ịlụ onwe gara nke ọma. Ihe ukwu nke dị n'alụm di na nwunye bụ uwe ha ga-eyi n'ahụ makwa nke ndị ga-abịanụ ga-eyi. Ndị a bụ uwe dị icheiche ndị be anyị na-eyi n'ala Igbo. Ejiji pụrụ iche Uwe nwaanyị na-alụ dị na-adị iche maka ọ bụ ya ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Nke nwoke na-apụkwa iche nke ya. Ọ bụnwaanyị ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-eme ịgbankwu na-eyị uwe elu na nke mwụda. Ọbụghị iwu na uwe a ga-enwe otu agwa, mana agwa akwa nwaanyị ga-eyi ga-emejurịta ibe ya. Aka uwe elu a nwere ike ịkwụsị ebe ọbụla. E nwere ike iji ọla akwa dị icheiche achọ ya mma. Uwe mwụda bụ ụdịrị akwa na-amasị ndị ibe nke nwunye na ndị agbọghọ bịara mmemme a. Ndị nwaanyị lụrụla di na-adị ama akwa n'ukwu. Ndị nwoke na-eyi uwe elu na traụza. Ụfọdụ na-ama akwa n'ụkwu. Uwe isi Nke a bụkwa uwe ọzọ dị mkpa n'ejiji alụm dị na nwunye dịka omenaala Igbo sịrị dị. Ọdụ ịnyịnya, okpu na ọla olu bụ ụfọdụ ihe eji achọ mma Nwaanyị nwere ike ịsụ ịchafụ n'isi. E nwere ike itinye ola uwe n'ịchafụ nke nwaanyị ka ọma ezigbo mma. Nwoke na-ekpu okpu isi. O nwere ike ịbụ okpu na-acha uhie uhie, edo na ndị ọzọ. Ọla, akpụkpọ ụkwụ na ihe ndị ọzọ Uwe a na-eyi n'igba nkwụ nwaanyị anaghị ezu oke ma ọbụrụ na ola dị icheiche adịghị na ya. Ọla ọcha, ọla edo, kọral, ọdụ na ọla a na-etinye n'akwa. Ha juru eju. Nwaanyị na nwoke na-agba uwe olu na nke aka. Ọzọkwa, nwaanyị na nwoke nwere ike iji ọdụ ịnyịnya. Nwaanyị nwekwara ike iji akụpe n'aka ma ọ chọọ. Abịa na akpụkpọ ụkwụ, ndị nwaanyị na-eyi akpụkpọ ụkwụ mara mma. Ufọdụ na-eyi nke dị elu maọbụ nke ala ka ha nwe ohere ịgba egwu. Nke ndị nwoke bụ nke e ji akpụkpọ anụ mee. Mkpọrọ na-eme ka ejiji nwoke N'ikpeazu, nwoke nwere ike jide mkpọrọ o ji aga ije. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46148551,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46148551,Air Peace: Ndị njem echela ọkpọ n'Enugu maka akpa ha a hapụrụ na Lagos,Mba rịrị onwe ya elu n'Enugwu n'isi ụtụtụ a ka ndị so ụgbọelu Air Peace si Legos lọta Enugwu chọwara akpa ha n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam.,"Air Peace: Onye njem agbaala ama maka ihe ụgbọelu ahụ mere akpa ya Ndị so ụgbọelu sị na njem gara n'udo site Legos ruo Enugwu. Mana, ka ha ruru Enugwu, ha chopụtara na akpa ha esoghi ha lọta. Otu n'ime ndị a aha ya bụ Ogbonna Obi kwuru na ọ bụghị izizi udiri ihe a na-eme n'ụgbọelu Air Peace. Ndị ọzọ so ụgbọelu a gwara BBC na ndị ọrụ Air Peace kwuru na akpa ha ga-apụta n'elekere atọ nke ehihie. Otu nwaanyi na-achọghị ka egosi ihu ya na onyonyo so n'ụgbọelu ahụ bara ezigbote mba. Ọ sị na ọ bụ makana ọgwụ nne ya ga-eji mee ọwụwa ahụ n'ụtụtụ a dị na akpa ha echezọrọ na Lagos. O kwuru na agaghị achọtalị ọgwu ahụ n' Enugwu. N'ọnụ ya, ""Ebumnobi m niile bụ na m ga-anọnyere nne m ma a na-awa ya ahụ."" Maazi Obi si na ya ga-agba mbọ hụ na ndi mmadụ matara maka ihe mere, ma kwukwa na ọ dịghị mma ka a na-anụ na nti na ụlọọru na-ekwu na ha chọrọ ibido gbawa mba ofesi na-eme ụdịrị ihe a. BBC gbara mbọ ịnwete Air Peace ka anụta olu ha maka ihe mere. Chris Iwarah, bụ ọnụ na-ekwuru Air Peace, sị na ihe a abughị ihe ọhụrụ kamana ọ na-eme mgbe niile n'ụgbọelu ọbụla. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44001662,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44001662,Iri oke nri ọnụụtọ so n'ihe na-ebute atụghị ime nwaanyị,Ụmụ nwaanyị na-eri oke nri ọnụụtọ nka a na-akpọ fast food n'asụsụ bekee na anaghị ara cha mkpụrụ osisi nkeọma na-enwe karị nsogbu ịtụrụ ime dịka nchọpụta kwuru.,"Nrị ọnụụtọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-erizi ugbua karịsịa ụmụnwaanyị N'ime nyocha emere n'etiti ụmụ nwaanyị dị 5,598, achọpụtara na ndị na-eri nrị ọnụụtọ 'fast food' ugbo anọ n'ime ọnwa anaghị atụ ime ọsịsọ dịka ndị anaghị ericha ọnụ ụtọ. Ndị na-eri nri ọnụ ntagharị a nakwaghị atụrụ ime ọsịsọ n'ime otu afọ dịka akụkọ gbasara ọmụmụ mmadụ ji kwuo. Ndị ọkacha ama tụrụ alọ na iri nri dị nma na-enye aka ịkwalite ohere ịtụrụ ime. Nyocha ndị a chọpụtara na ọ na-ara ụmụ nwaanyị na anaghị eracha mkpụrụ osisi ahụ tupu ha tụrụ ime karịa ndị nke na aracha ya nkeọma. Onye dọkịta na-esoghị na nyocha ahụ bụ Ọkanmụta Claire Roberts nke Mahadum Adelaide na Australia kwuru na nyocha a kwadoro ihe ndị ọkacha n'ihe gbasara ahụike na-ekwu. Nke bụ na dị na nwunye na-achọ nwa kwesiri ị na-eri ezigbo nri. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari n'ahụ gị" 42884090,https://www.bbc.com/igbo/42884090,Ndị ome ihe nkiri 'Black Panther' gosiri Afrịka n'emume mbido ha,"Ndị so mee ihe nkiri ""Black Panther"" goziri omenala Afrịka mgbe ha gara mmeme mbido ya bụ ihe nkiri nke ụlọọrụ Marvel mepụtara.","Ha niile kere ekike mba Afrịka di icheiche maka na ha kwuru sị na ọ dị mkpa igosi Afrịka nke ọma. Chadwick Boseman bụ onye jere ozi dịka T'Challa, Eze mba Wakanda, bụ onye e ji maka ya mee ihe nkiri ""Black Panther"", duuru ndị ọzọ nọ n'ihe nkiri a gaa ebe emere mmeme a na Los Angeles. Ndị dịka Lupita Nyong'o, David Oyelowo, Daniel Kaluuya, Michael B Jordan, Danai Gurira na Angela Bassett kere ekike ndị Afrịka. N'akwụkwọ eji gwa ndị mmadụ maka mmeme a, e dere sị ha jikere ka ""ndị eze Afrịka"". David Oyelowo bụ nwa afọ Naịjirịa na Nwunye bụ Jessica so bịa emume a Janeshia Adams-Ginyard nọchitere anya Danai Gurari dịka Okoye Dora Milaje na ihe nkiri a Lupita Nyong'o bụ onye Kenya nweterela ihe nrite ndị na-eme ihe nkiri a na-akpọ Oscar Chadwick Boseman bụ onye mere ka T'Challa n'ihe nkiri a Danai Gurira bụ nwa afọ Zimbabwe mere ka Okoye Dora Milaje n'ime ihe nkiri a Ọ ga-adị mma ka ndị ome ihe nkiri ndị ọzọ na Hollywood bido ije omume ha a?" afirika-54978374,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54978374,"Chronic Respiratory Disorders: Lee etu ị ga-esi gbalahụ 'Asthma', 'sleep apnea' na ọrịa ngụ ndị ọzọ?","Chioma Mgbemena( ọ bụghị ezi aha ya) dị afọ iri na isii oge ọrịa asthma jidere ya n'ụzọ pụrụ iche, e buga ya ụlọọgwụ ebe a zọtara ndụ ya.",""" Etum na isi mmanụ ụgbọala anaghị adị m mma na-ahụ. Oge ọbụla m na-aza ụlọ, imi na-ebido na-agba m maọbụ na-eze uzere aghara aghara mana akpọghị m ya ihe ọbụla."" ""Mana ọ bụ oge m dị afọ iri na isii m dara ahụ menyere m egwu n'ahụ ka e buru m gbaga ụlọọgwụ ebe dọkịta chọpụtara na enwere m ọrịa 'asthma."" Mgbemena dị afọ iri atọ ugbua, mana ọrịa ahụ ka na-echere ya aka mgba. ""Ọrịa na-enye m nsogbu ị ga ọrụ n'ihi na enweghị m ụgbọala nke aka m. "" Ọ bụghị ọgbakọ ọbụla ka nwaada Chioma na-ala. Ụfọdụ na-akpachapụ ya n'ihi ọrịa nke mere na ọ naghị agwa ndị mmadụ ọnọdụ ya. Asthma so otu n'ime ọrịa ndị a kpọrọ 'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs). 'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs) bụ ọrịa ndị na-emetụta ngụ maọbụ akụkụ ngụ. Ọrịa ndị na-emetụta ngụ gụnyere ma ewezụga ọrịa asthma gụnyere ""chronic obstructive pulmonary disease"" (COPD), ""Sleep Apnea"", ""Bronchitis"" wdg. Dịka WHO si kwuo, ọrịa na-emetụta ngụ na-egbu ihe karịrị nde mmadụ anọ kwa afọ gụnyere ndị okenye na ụmụaka. Ọ bụ ike ọgwụgwụ na ume ọkụ mere m jiri chọpụta na m nwere ọrịa obi - Onyinye Eze. Kedụ ihe ndị nwere ike ịbute ọrịa ndị a? Ihe ndị na-ebute ọrịa CRD gụnyere etum,ịṅụ anwụrụ, kemịkal nakwa inwekarị ọrịa ngụ n'efe efe n'ụmụaka. Dịka Dọkịta Funmi Akinde nke Lagos University Teaching Hospital Luth bụ onye dọkịta ihe na-eme n'ime ahụ doro anya siri kọwaa, lee ihe ụfọdụ na-ebu ọrịa ndị a : Asthma Ọrịa 'asthma' bụ ọrịa nke ọwa ikuku na-akpachi, na-akpaghe ma na-ewepụta ụkwara. Njirimara ọrịa 'asthma' gụnyere; umeọsọ,ụkwara,uwe ịra ahụ,ume ime mkpọtụ na obi mgbu. Ihe ndị na-ebute asthma bụ; Chronic Obstructive Pulmonary Disease (COPD) COPD bụ ọrịa na-ebute mkpochi ngụ nke na ikuku anaghị aga dịka o kwesịrị. Njirimara 'COPD' Ihe ndị na-ebute'COPD'bụ; ""Obstructive Sleep Apnea"" Nke a bụ ọrịa na-eme ka mmadụ na-ekubi ume ma ọ na-arahụ ụra. Njirimara 'sleep apnea' gụnyere; ịgwọ ụra,oke ụra n'ehihie, isiọwụwa ụtụtụ, ọbara mgbalielu na ike ọgwụgwụ n'ụtụtụ n'ihi arahụ ụra nke ọma n'abalị. Ihe ndị na-ebute ya bụ; Ọrịa ngụ a na-ebute n'ọrụ Onye na-arụ ebe a na-egwupoụta kolu, ọlaedo nakwa ọnatarachi ndị zọ nwere ike ibido rịawa asthma maọbụ ọrịa ngụ ndị ọzọ E nwere ọrịa ngụ a na-ebutekarị n'ọrụ nke Bekee kpọrọ ""Occupational lung diseases"". Nke na-emetụta ndị na-arụ ebe a na-egwupụta ihe n'ala, ndị na-akụwa okwute, ndị na-ete uhie(painters) maọbụ na-arụ ebe a na-emepụta ụhie nakwa ndị na-arụ ebe a na-emepụta asbetọs. Dọkịta Funmi Akinde kwuru na"" ụfọdụ ndị ka ọrịa na-ebutu ma ha rụọ ọrụ ihe dịka afọ iri maọbụ iri na ise ebe a na-eme ihe ndịa."" Funmi Akinde: ""Ndị na-azụ ọkụkọ maọbụ nnụnụ 'pigeon' , ndị na-egwupụta ihe n'ime ala, ndị na-arụ kapịnta nwere ike ibute ọrịa ngụ "" Ọ gara n'ihu sị, ""Ndị na-azụ ọkụkọ maọbụ nnụnụ 'pigeon' nwere ike ibute ya dịka nsị ha nwere ajọ ikuku si n'ime ya nwere ike imerụrụ ngụ ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ echekwaghị onwe ya ọfụma."" Ụzọ Mgbochi Onye ọrụ kapịnta anaghị egbuchi imi na ọnụ ya nwere ike ibute ọrịa ngụ Ileta onye na-arịa ọrịa ngụ Ọtụtụ mgbe, a naghị agwọchapụ ọrịa ngụ mana onye nwere ya bụ ọrịa nwegara ihe o kwesịrị ị na-eme iji hụ na ọ kwụ chịm Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42807375,https://www.bbc.com/igbo/42807375,IPOB: Ihe Obasanjo kwuru maka Buhari bụ eziokwu,"Ọnụ na-ekwuru otu Biafra (IPOB) bụ Emmanuel Powerful ekwuola na ndị nnọchịtere APC ọdịda anyanwụ kwadoro nhọpụta onye isi ala, Muhammadu Buhari maka ịzọ ọkwa ọzọ bụ ""ndị akwụna ndọrọndọrọ ọchịchị"".","Gọọmentị etiti kpọrọ IPOB otu ndị oyi egwu N'akwụkwọ ozi Emma Powerful zipụrụ ndị ntaakụkọ, o kwuru na IPOB nwere nkwado n'ime okwu onye isi ala Naijiria mbu bụ Olusegun Obasanjo kwuru. Cheta na ụnyaahụ,Obasanjo, kwuru na ọ ga dị mma ma ọ bụrụ na Buhari gbahapu ịzọ ọkwa ọzọ na afọ 2019. N'ime ozi ahụ IPOB dere sị, ""Ihe Obasanjo kwuru bụ echiche onye isi anyi bụ Nnamdi Kanu. Obasanjo kwuru ezi okwu. Ndị niile gara ileta Buhari kwesịrị ikpuchi ihu ha n'ihere.""IPOB akpọrịala ndị APC ọdịda anyanwụ Onweghi onye ma ebe Nnamdi Kanu, onye isi IPOB nọ ugbua IPOB bụ otu na-achọ mnwere onwe ọchịchị nke ha, a ga-akpọ Biafra. Na ụbọchị isi gara aga, ụlọ ikpe nọ n' Abuja kwetara na IPOB bụrụ otu na-eyi egwu. Mana IPOB ekwuola na ha ga ebuga ikpe n' ụlọ ikpe kachasi n'ala Naijiria Ugbua, onweghi onye mara ebe onye isi ndị IPOB bụ Nnamdi Kanu nọkwa. Ụlọ ọrụ onye isi ala enweghị ihe a kwuru banyere okwu Obasanjo kwuru gbasara Buhari na ịzọ okwa ọzọ na 2018. Chetakwa na onye isi ala Muhammadu Buhari ekwubeghị ma ọ ga-azọ ọkwa ọzọ na afọ 2019." afirika-51307386,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307386,"Coronavirus egbuola mmadụ 170, jide mmadụ 7834","WHO etiela mkpu si ka mba ụwa kee nkwucha dịka ọrịa Coronavirus ghọrọla nnukwu nsogbu nye ahụike ọha na eze mba ụwa nke Bekee kpọrọ "" Public Health Emergency of International concern"".","WHO gbara ama na ya bụ ọrịa egbuola m mmadụ otu nari na iri asaa, ebe ya bụ ọrịa ji derela mmadụ. N'ozi ha wepụtara n'abali Tọzde, WHO kwuru na ọtụtụ ndị ọrịa si mba China dịka ngụkọ gosiri na mmadụ 7736 nke pụtara mmpasent 99 ndị bu ya bụ na mba China. Ha kwuru na ihe gara aka njọ ma ọ bụrụ n'ọbụghị na mba China bidoro n'ehihie chọwa ewu ojii. Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi otu WHO Ihe ndị a nile pụtara ihe na mkparitaụka nke Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi otu WHO na ndị ntakụkọ nwere . ""Aha a ga na-akpọgodị ọrịa coronavirus ọhụrụ a bụ ""2019-nCoV acute respiratory disease"" Orịa Coronavirus nke bidoro na China n'ọgw ụgwụ afọ 2019 abanyela na mba Japan, Vietnam nakwa Germany. Gịnị bụ isiokwu nzuko Buhari na Jonathan nwere? Onyeisiala Muhammdu Buhari lere onye bubụ Onyeisiala bụ Goodluck Jonathan ọbịa n'obi ọchịchị Aso Rock n'ụbọchị Tọzde. Ndị isi abụọ a nwere obere mkparịtaụka ime ụlọ bụ nke na-ewere ihe dịka nkeji iri. Jonathan mgbe ọ pụtara agwaghi ndị ntaakụkọ okwu mana kepukepu kwuru si n'akwụkwọ Punch sị na ọ bịara ikele Buhari maka nkwado o nyere ya mgbe a wakporo ụlọ ya. Akụkọ kwukwara na Buhari kwere Jonathan nkwa na a ga-echekwa ya. Cheta na Jonathan bịakwara ụdị njem a n'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba, 2019. Bruno ọ ga-ebuputa Manchester United? Otu egwuregwu Manchester United azụọla Bruno Fernandes na-agbara Sporting Lisbon bọọlụ n'ebe etiti. Manchester United ji ọnụego dị nde paund iri anọ na asaa zụta Fernandes bụ onye ga-abara ha bọọlụ ruo afọ ise na ụma. Dịka ọ na-etinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, Fernandes sị na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ọ mabutere iko na Manchester United. Ọwụwanyanwụ ga-enwe ndị ọrụ nchekwa nke ha - Umahi Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ọgbakọ gọvanọ ndị ọwụwa anywanwụ kwuru nke a n'Abakaliki n'ụbọchị Wenzde. O kwuru na ọ bụ iji chekwa ndị Igbo n'aka ndị ọchịehi Fulani na nsogbu ndị ọzọ n'ebe ndụ na akụnaụba ha dị. Ọ kpọpụta beghị aha ọbụla a ga-agụ otu ahụ mana a na-atụ anya na ọ ga-amalite n'oge adịghị anya. Buhari na ndị ọru nchekwa na-eme nzukọ n'Abuja Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ndị isi ọrụ nchekwa niile nzukọ na-aga n'ihu n'Abuja ugbua. Nzukọ a bụ nke ndị akpọrọ ""National Security Council Meeting"" na-eme n'Obi Gọọmentị dị n'Abuja. Nke a na-abịa n'azụ ụfọdụ ndị omeiwu sị ka ndị isi ọrụ nchekwa rituo n'ọkwa maka oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa. Otu onye n'ime ha bụ Enyinnaya Abaribe sị na Onyeisiala Buhari n'onwe ya kwesiri iritu. Lee ihe onyonyo si nzukọ a pụta ọnụ na-ekwuru Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara. Coronavirus ka na-akpọtụ taa Otu nwata akwụkwọ Naíjiría na-agụ mahadum na Chaịna agwala BBC Igbo ihe ha na-agabiga dịka ọrịa Coronavirus na-abawanye na mba ahụ Nwaokoroọbịa ahụ aha bụ Emmanuel si na ọ bụ kwa ụbọchị ka a na-enyocha ha ahụ ịmata ka ha enwere ịba. Ọ sị na nke ka njọ bụ na anaghi ekwesi ka mmadụ me ngaghari na-ejighi ikike nke mere na agụ bụzi ezigbote nsogbu ha nwere ugbu a. Nke a na-abịa dịka ekwuputala na nje Coronavirus abaala mpaghara Chaina niile ma gbuo mmadụ otu narị na iri asaa ebe mmadụ puku asaa na narị asaa bu ya na ya bụ mba. N'egwuregwu, Novaj Djokovic na Roger Federer na-asọmpị onye ga-agafe ruo agba nke ngwụcha na iko Australian Open Na asọmpị ụmụnwaanyị Garbine Muguruza mere Simona Halep iji ruo agba nke ngwụcha Abaribe ekwughi uche ụmụ Naịjirịa - Garba Shehu Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Graba Shehu asaala Enyinnaya Abaribe maka oku ọ kpọrọ ka Onyeisiala gbaa arụkwaghị m. Shehu kọwara na oku ahụ enweghi isi nakwa ọbụghị uche ụmụ Naịjirịa. Ebe Buhari Resign na-ewusike na Twitter dịka ndị mmadụ ji ya a kpọ oku ka Onyeisiala Muhammdu Buhari ritue n'ọkwa ọchịchị. N321m maka akwa mmiri Niger abụọ N'akụkọ yiri ya, gọọmentị Naịjirịa ahazichaala usoro a ga-esi weghachite nde naira narị atọ na iri abụọ na otu so n'ego Abacha zopuru Naịjirịa Ha kwuru na ego ahụ ka a ga-eji rụọ okporoụzo Lagos na Ibadan, nke Abuja na Kano nakwa Akwa mmiri Niger nke abụọ. Na mba ofesi, Mba Cote d'Ivoire ekutuola ugbua dịka a chọpụtara na onye e chere na o bụ Coronavirus ebughị ya bụ ọrịa. N'akwụkwọ ozi ha depụtara ha kwuru na nwata akwụkwọ ahụ si Pekin bata Abidjan alaala be ya. N'egwuregwu, Otu Manchester Utd azaala aha nna ha mgbe ha ji otu ọkpụ goolu merie otu Manchester City. N'agbanyeghị nke a, otu Mancity eruola agba ikpeazụ n'asọmpị iko EFL ebe ha ga-ezute Aston Villa. Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50807053,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50807053,The First Temptation of Christ: Netflix o mere Jesus arụ?,#BoycottNetflix na-ewu na soshal midịa dịka ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ihe nkiri ọhụrụ ụlọọrụ ihe nkiri ahụ wepụtara a kpọrọ 'The First Temptation of Christ'.,"Ihe karịrị nde mmadụ na-ekiri 'Netfilix' binyere aka n'akwụkwọ iji kwụsị ụlọọrụ ahụ iwepụta ihe nkiri ahụ makana ọ na-akparị ndị otu ụka kraisti. Kedụ ihe dị n'ime ihe nkiri a?(Ihe mgbawa obi juru ya) Ihe nkiri a bụ ihe ọkpaọchị nke otu nọ na Brazil a kpọrọ Porta dos Fundos (azụ ụnọ) wepụtara. O ruru nkeji iri anọ na isii na-egosi ebe Joseph na nwunye ya Mary na-ezukọrịta na be ha. Ọ malitere ebe ụmụnwoke atọ nwere amamihe na-achọ ""Jesu"" site na kpakpando. Ka ha fuchara ụzọ, ha mechara rute n'ụlọ Mary na Joseph. Ha abụọ nọ na-akwado emume ncheta ọmụmụ ""Jesu"" nọ n'Ọzara kamgbe afọ 40. ""Jesus"" mechara bata njem ọ nọ n'ọzara kamgbe afọ iri anọ, ya na ọyị ya nwoke akpọrọ Orlando. Ihe nkiri a na-akọwa na ""Jesus"" na Orlando na-enwe mmekọrịta nwoke na nwoke mana ""Jesus"" gọrọ ụkwụ na aka ya sị na ya na Orlando bụ naanị ọyị na ọyị. Ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere nke butere echiche a. Mana n'ikpeazụ, Orlando gosipụtara onwe ya dịka ekwensu bịara ịnwa ""Jesu"" ọnwụnwa n'ọzara, ma na-achọ ka ọ dachapụ n'oku Chineke kpọrọ ya. Ka o si dị ugbua, Netflix azachịghabeghị mkpesa ndị mmadụ na-eme maka ihe nkiri a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ihe nkiri a @APOSTLESULEMAN rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ikiri Netflix. @elnathan_john kwuru na ebe ndị ụka Kraisti na-akatọ ndị ọzọ na-akpọ ha ndị ekweghị , ha na-ekwu ka aghara ịkatọ nke a? @LawrenceOkoroTL kwuru na ya ga-agbajọ Netflix. @aspirin_n kwuru na ya bụ ihe nkiri akwanyeghị ụka Kraisti ugwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasi gị Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a" afirika-52165477,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52165477,"Lock Down in Nigeria: Gbanahụ oke ibu, 'afọ beer' site n'iri nri ndị a n'oge a",Ị na-atụ ụjọ ibu oke ibu maọbụ inwe 'afọ beer' n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ nke gọọmenti manyere onye ọbụla ruo?,"Nwanne bute oche ka ị gụọ ihe nwada Igbo a bụ ọkammụta gbasara nrị na ihe o na-enye n'ahụ kpọpụtara dịka nri ị nwereike iri wee gbanahụ ọrịa ịnọ otu ebe na-ebute Nọọsụ Adanna Monday kwuru na ugbua ohere ịnọ n'ụlọ dapụtara, ọ dị mkpa ka onye ọbụla jiri aka ya na-esi nri ya ugbua. O kwukwara na mmadụ kwesiri ị na-ahazị oke nri ọ na-eri kwa mgbe. N'okwu ya, ""iri ezigbo nri ga-eme ka ọrịa dịka oke ibu, ọbara mgbali elu, diabetes, gbaara mmadụ ọsọ."" Lee nri ise okenye na ụmụaka ga-eri ka ha chụpụ ọrịa niile na-abịa ma mmadụ na anọkarị otu ebe 1. Mkpụrụ osisi Nọọsụ Adanna kwuru na irikarị mkpụrụ osisi ga-eme ka ọrịa ịnọ otu gbalaga. Ụfọdụ mkpuru osisi ọ gụputara gụnyere orọma, 'lemon', 'strawberry', na mango bu ezigbo vitamin C ebe water melon ga-enye gị ezigbo mmiri n'ahụ. Apple bụkwa mkpụrụosisi ga-enye gị nnukwu ""Fibre"" ga-edozi ahụ gị. 2. Akwụkwọ nri Riwe ụgụ na spinach ọfụma maka na 'green' ha tọrọ atọ dịka dọkịta Adanna si kwuo. Nke a ga-enye gị ihe ndị nwereike iluso nje agha n'ahụ gị. 3. Anụ ọcha Ọ na-abụ ịhụ anụ ehi ahụ a na-ama gị jiji? Biko ọ bụghị maka oge a. Nọọsụ Adanna kwuru na anụ dịka azụ ọcha(crocker maọbụ tilapia), anụ ọkụkọ maọbụ anụ 'turkey' na ka mma n'oge a maka ịgbanahụ ọrịa. Nke a ga-eme ka ahụ gị ghara ị na-anyị gị arụ mgbe niile. 4. Kabọhidreti pụrụ iche Dọkịta Adanna gụpụtara nri a dịka osikapa ọfada , osikapa nke si n'ubi ghara ịgabiga ọtụtụ mgbanwe. Ọ gụnyere beans, potato na legume niile makana ha ga-eme ka ịghara ị na-ata cham cham. 5 Nri bu fati na-edozi ahụ Nri ndị a bụ nọtụ, salmon, olive oil, Mackerel na ube oyibo. O kwuru na nri ndị a na-edozi obi mmadụ mana ọ ga-adị mma ka mmadụ ghara iribi ga ya oke maka ibu, tụmadị ọ bụrụ na ị na-agbara ibu ọsọ. Nke a bụ makana ha bu ibu karịa protein na kabọhidret. N'ikpeazu, dọkịta Adanna kwuru ka ndị mmadụ na-aṅụ mmiri ọfụma n'oge a. Ọ bụrụ na o kweghị gị, gote mkpuru osisi juputere na mmiri dịka 'water melon' tawa." afirika-51788457,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51788457,Ngọzị Okonjo-Iweala: Ihe mere ụwa jiri echu nwa ada Igbo a ka mmiri ngene,Nwaada Igbo bụbu Minista okwu ego dị n'aka bụ Ngozi Okonji Iweala bụ onye so agbaọsọ onyeisi World Trade Organisation (WTO) na-ekele ndị niile na-ekpere ya ekpere ọma nakwa ndị niile na-akwado ya na ya bụ ọsọ onyeisioche.,"Ọ na-ekelekwa Onyeisiala Muhammadụ Buhraị nakwa ndị ọrụ WTO bụ ndị na-akwado ya na ya bụ nhọpụta dịka ha na-eke nkwụcha maka agba nke ikpeazụ. End of Twitter post, 1 Akụkọ na-ekwu na Okonjo-Iweala so mmadụ abụọ fọrọ na ndọrọndọrọ ọkwa onyeisi otu na-ahụ maka mgbere na mba ụwa bụ World Trade Organisation (WTO). Ya bụrụ na Okonjo-Iweala meriri ọ ga bụrụ nwaanyi mbụ nakwa onye Afrịka mbụ na-achị ngalaba WTO. Ị bụ onyeisi WTO ga-enye Okonjo-Iweala ntụru ugo pụrụiche ọhụrụ gunyere ndị kpọcha kpọcha o nweburu. Onye bụ Ngozi Okonjo-Iweala? Nwaanyị a bụ onye gụru akwụkwọ na mahadum Harvard ebe o nwetere asambodo maka ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jun, 1954 dịka Ngozi Okonjo. Nna ya bụ Chukwuka Okonjo bụbu obi nke Ọgwashị Ukwu na Delta steeti. Di ya bụ Dọkịnta Ikemba Iweala Nwa ya nwoke bụ ode akwụkwọ a ma ama bụ Uzodinma Iweala. Ọ bu ya bụ nwaanyị mbụ rụrụ ọlụ dịka minista minista ego nakwa mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ. Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi na ụlọ akụ mba ụwa nke Bekee kpọrọ World Bank. Okonjo-Iweala na Onyeisiala mba Saụt Afrịka b Cyril Ramaphosa Olileanya Okonjo-Iweala na WTO A bịa na olielenya WTO, Okonjo-Iweala chọrọ ha ngalaba ahụ nọdụ n'ihu inyere mba enweghi ego nwete ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ covid-19. Ọ chọkwara imezi mmekọ mba Amerịka na ngalaba WTO. Amerịka na-akatọ ngalaba ahụ maka usoro ya na-eme mba Chaịna ka mba ka na-emepe emepe. Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala Ihe mere aha ya ji ada ụda oge ọbụla 1: Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nke abụọ na ""World Bank"" Okonjo-Iweala no afọ iri abụọ na ise na ""World Bank"" ma ruo ọkwa a kpọrọ ""Managing Director, Operation (2007-2011). Ọ rụrụ ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ ""Development Economist"" na Ụlọakụ Mbaụwa bụ ""World Bank"" 2: O mepeere ụmụnwaanyị ụzọ ịbụ minista ego na Naịjirịa Obasanjo na Ngozi Okonjo-Iweala Ọ bụ Olusegun Obasanjo kpọlatara Okonjo-Iweala ka ọ bịa nyere obodo ya aka dịka Minista na-ahụ maka ego. Ọ malitere ọrụ n'afọ 2003 ruo afọ 2006 were laghachi Ụlọakụ ""World Bank"". N'afọ 2011 Goodluck Jonathan bụ onye bụ onyeisiala n'oge ahụ kpọkwara ya okwu ife ala nna ya. Ọ rụru ọrụ dịka minista ego ọzọ ruo afọ 2015. Ọ bụ 3: Aka ya dị n'ịtọpụ Naịjirịa na agbụ iji ụgwọ Ọ bụ oge Okonjo-Iweala bụ Minista na-ahụ maka ego ka Naịjirịa nwetera mgbaghara ego nọ na-asụgbụ ha kemgbe ebutere ya n'aka ndị a kpọrọ ""Paris Club"". Ego agbaghara n'oge ahụ bụ ijere dọla iri na asaa. 4: Ụlọ ọrụ ọkaibe na mbaụwa ejighị ya egwu egwu Okonjo-Iweala na onyeisi IMF bụ Christine Lagarde A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala? A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya. A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm. Nke pụtara ihe mere ndị mmadụ ji achọ ya ka azụ si akchọ mmiri Ọ bụ otu n'ime ndị ndụmọdụ ụlọọrụ Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter, ma bụrụkwa nke ụlọakụ Standard Chartered. Ọ bu onyeisi ndi ndụmọdụ ngalaba a kpọrọ ""African Risk Capacity"" nke Otu Mba Afịrịka nakawa nke Gavi (bụ ngalaba na-ahụ maka ọgwu mgbọchị ọrịa ụmụaka). Ka ọ kwu ugbua, ihe ọfọdụ ndi seputere isi na-enye ya bụ ekele maka ugo ọhụrụ ọ tụrụ. Peter Obi sị ya deme ma na-asi na ya ma na ọ ga-eme ọfụma. Aka na-achị steeti Delta bụ Ifeanyi Okwa na-enye ekele ma na-akwado ada ha nwaanyị. Atiku Abubakar sokwa kelee ya" afirika-44193678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44193678,Akwụnakwụna: Ụlọikpe dị na Paris na-ekpe ụmụ Naịjirịa ikpe,Ndị ụlọikpe na Paris dị na mba France na-ekpe ụmụnwaanyị Naịjirịa 16 ikpe maka ebubo na ha na-eme ụmụnwaanyị ka ha dina nwoke n'ike .,"E bidoro ikpe a kamgbe ụbọchị 14 ọnwa Mee nke a na-ekpe otu kpọrọ onwe ha 'Authentic Sisters.' Ụmụnwaanyị asatọ agaala ụlọikpe ikwupụta n'ezie na e mere ha n'ike idina nwoke maka ego mgbe ha si Naịjirịa kpọrọ ha bịa. Ikpe a metụtara ụmụnwaanyị ndị ọzọ ruru mmadụ 49. A na-ebo ụmụnwaanyị ahụ na ha ji asị we kpọrọ ụmụnwaanyị na Naịjirịa dịka ha gwara ha na ọ bụ na ụlọ ebe a na-ere nri ka ha ga-arụ na Yurope. Mana oge ha ruru, e debere ha n'ime ụlọ nye ha okpunnabuenyi ka ha ga chọọ nwoke ha ga-edina. Otu n'ime ụmụnwaanyị ihe a metụara kwuru na e buru ụzọ kpọgaa ha na arụsị dibia ka ha ṅụọ iyi na ha agaghị agwa ndị uweojii ihe ha na-eme. N'ime mmadụ 16 a na-ekepe ikpe maka ịgba akwụna, ịkpọpụ mmadụ n'ike, mmadụ 11 n'ime ha bụ ụmụnwaanyị ebe mmaọdụ ise bụ ụmụnwoke. Mmadụ anọ n'ime anọrọla n'ụlọ nga maka ihe ndị ọzọ ha mere. Ayaara mba France, ndị ọkaiwu gọọmenti kwuru na otu akwụna ha gara mba ndị ọzọ dịka mba Itali na Spen. Otu na-enyere ụmụnwaanyị ahụ a kpọpụrụ n'ike aka inweta ndị ọkaiwu kwuru na ọ na-ahịa ụmụnwaanyị ndị gabigara ụdị ihe a ahụ ịpụta n'ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53217151,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53217151,A tọhapụla Pastọ dara iwu COVID-19 n'Ebonyi steeti,Ebelebe gburu n'Ebonyi steeti ụnyaahụ mgbe ndị ọrụ gọọmentị na-ahụ maka ọrịa coronavirus gakwutere otu Pastọ dara iwu ọrụ ha.,"Bishop Dan Obinegbo bụ onyeisi nchụaja ndị Christain Victory Prayer Ministry, Abakaliki kabigara ụka awa ole iwu kwuru. Iwu gọọmentị steeti ahụ sị ka ụka ghara ịgafe elekere iri na abụọ nke ehihie, mana ya bụ ụkọchukwu gafere ya bụ oge. Mgbe ama gbaara ndị kọmitii COVID-19 na steeti ahụ, Stanley Okoro-Emegha bụ Kọmishọna na ahụ maka nchekwa obodo na okeala gara ebe ahụ ịkwụsị ya ụka, mana akụkọ kọrọ na ọ gbara isiakwara. Nke a mere Okoro-Emegha ji nye iwu ka a kpụrụ ya gawa n'ogige nchekwa mgbe ọ kachara ụka mgbe ọ gafere elekere abụọ nke ehihie, ebe a ga-enyocha ma o bu ya bụ nje coronavirus. Ekwesiri isi ebe ahụ kpọga ya na ndị otu ya n'ogige ndopu bụ ebe ọ ga-anọ izuụka abụọ. Mana Kọmishọna Okoro-Emegha sị na Gọvanọ sị ka atọhapụ ha n'ụtụtụ a ma kpochie ụlọụka ha. Umahi mechiburu ụlọikpe niile dị n'Ebonyi steeti dịka otu onye nwuru n'ọrịa coronavirus. Mana gọọmentị sị na onye ahụ nwụrụ abụghị onye ọrụ ndị ụlọikpe mana ha mechiri ụlọikpe ka ha nwee ike sachaa ebe ahụ. Ọnụọgụgụ ndị bu nje coronavirus na-agbali elu n'ike n'ike n'Ebonyi steeti. Mmadụ 68 ka a hụrụ nje a n'ahụ ha ụbọchị Sọnde dịka ngalaba NCDC si kwupụta. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-57097191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57097191,Ohaneze Ndigbo: Ndị ọjọọ agaghị etinyenwu ọgbaaghara n'etiti ndị Igbo na ndị Yoruba - George Obiozor,Otu Ohaneze Ndigbo agwala Gọvanọ Legọs steeti Babajide Sanwo-Olu ka ọ wepu uche n'akụkọ na-ekwu na ndị otu IPOB na-akpa nkata Ịwakpo steeti ahụ.,"George Obiozor na Babajide Sanwo-Olu Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru nke a oge ọ gara njem nleta n'obi gọọmentị Legọs n'ụbọchị Tọzde. Obiozor kwuru na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha nke ndị obi ọjọọ chọrọ iji tinye ọgbaaghara nakwa tigbuo zọgbuo na steeti ahụ. ""Ọgbaghara daa na Legọs, ọ ga-emetụta anyị niile bụ ndị Igbo,"" Obiozor kwuru. ""Ndị Igbo agaghị eme ihe ọbụla ga-emebi ọdịmma anyị na ndị Yoruba, ọ kachasị na Legọs ebe ọtụtụ ndị Igbo bi."" Joe Igbokwe, Babajide Sanwo-Olu, na George Obiozor ""Anyị chere na-akụkọ asị a bụ iji megharịa gọọmentị Legọs anya na mbọ ha na-agba ime ka ndụ dịrị ndị mmadụ mfe."" ""Ndị Igbo bụ ndị e ji mwulite obodo mara, ọ bụghị ndị na-emebi emebi. Ihe ndị Igbo mepụtagoro na Legọs doro ewu na ọkụkọ anya. ""Obi tọkwara anyị ụtọ mgbe ndị otu IPOB n'onwe ha pụtakwara kwuo na ya bụ akụkọ abụghị eziokwu."" George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị Obiozor gara n'ihu kwuo na Ohaneze Ndigbo ga-enye ọchịchị Sanwo-Olu nkwado niile ọ chọrọ n'aka ha iji hụ na ọchịchị ya mịtara mkpụrụ. N'aka nke ya, Sanwo Olu kelere ndị Ohaneze ma kwuo na ọchịchị ya ga na-agba mbọ maka ọdị mma mmadụ niile. Cheta na ọ bụ onyeisi ndị uweojii steeti Legọs, Hakeem Odumosu, kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ndị otu IPOB na-akpa nkata ịwakpo Legọs. Mana Nnamdị Kanu, onyeisi ndị IPOB, kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu. Ọ bụ nke a kpatara ndị isi Ohaneze Ndigbo jiri gaa na nke Sanwo-Olu iji gwa ya n'ezie na ndị Igbo agaghị achọ imebi ihe na Legọs." afirika-44310668,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44310668,Ncheta Biafra: Ndị uweojii Abịa sị na ha amaghị maka onye egburu n'Aba,"Ka a na-eme emume ncheta Biafra ụnyaahụ, ọtụtụ akụkọ pụtara n'ọwụwa anyanwụ banyere ihe na-eme.","Ibrahim Idris bidoro ịchị ndị uweojii Naịjirịa n'afọ 2016 N'Aba dị n'Abia steeti, ndi mmadụ dere na soshal media na otu okoroọbịa aha ya bụ Kelvin Nnamdi Ikemeh, nwụrụ n'aka ndị agha Naịjirịa, mana BBC Igbo gbara mbọ ịmata nke bụ eziokwu mana anyi enweteghị anya hụru mgbe o mere. Akụkọ okwu ọnwụ nwa amadị a sị na ndị e chere na ha bụ ndị agha ala anyị gbagburu Kelvin dịka ya na ndị agbataobi ya nọ n'ihu ụlọ ha n'Uranta dị nso n'ụzọ Pọt Hakọt n'Aba. Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti, bụ Geofrey Ogbonna iji mata nke bụ eziokwu, o kwuru na ọ maghi maka ya. Ogbonna kwuru; ""enwetabeghị m ozi ọbụla maka nke a"" ma kwukwa na ọ ga-achọpụta nke bụ eziokwu. Etu ọ dị ugbua, anyị ka na-etinye anya n'okwu a ịchopụta nke gara na etu o si ga. Nkọwọta: Akụkọ a kwubụrụ na ndị agha gbagbụrụ nwa amadi a mana anyị degharịrị ya igosi na anyị achọputabeghị nke bụ eziokwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48903125,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48903125,Women's World Cup 2019: Ụmụnwaanyị Amerịka ebuliela iko Mbaụwa nke ugboro anọ,Ndị egwu bọọlụ ụmụnwanyị nke mba Amerịka emeela ndị ogbo ha nke mba Netherlands taa kpuchie ọnụ n'asọmpi nke ikpeazụ Iko Mbaụwa taa.,"Amerịka ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata wee menyụọ ndị Netherlands anya ma maburu ya bụ iko. Ọkpụ goolu gaara akarị akarị ma ewepu onye oche goolu ndị Netherlands onye gosiri na ọ bụ agụ nwanyị n'ezie. Mana na nkeji 61, ndị Amerịka nwetara penariti nke onye ndu ha bu Megan Rapinoe gbakpuru wee kọwaara ndị Netherlands na-egwu apụọla na nke achị ụtaba n'aka agba. Rapinoe onyendu ndị Amerika bụ onye kacha bụrụ okenye nke nyerela goolu na asọmpi iko mbaụwa ụmunwanyị Rapinoe onye gbara afọ iri atọ na anọ bụ nwanyị kacha bụrụ okenye nke nyerela goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmunwanyị Na nkeji 69, Rose Lavelle mezuru ya ọkpụ abụọ, nke bụ goolu nke atọ ọ na-enye n'asọmpi nke afo a. Obi agbawaala ụmụnwanyị Netherlands Mmeri a egosila na mba Amerịka bụ ọkaibe ma a bịa n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwanyị. Nke a bụ ya ugboro anọ ha na-eturu ugo na ya bụ asọmpi kemgbe amalitere ya n'afọ 1991. Nke gụnyere 1991, 1999, 2015 na 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48278561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48278561,Thailand: Nkịta zọro nwa ọhụrụ e liri na ndụ,A na-ekwu na nkịta nyara akpa nsi agwụ n'ọhịa .,Ọ bụ nkịta mere ihe onye nwe ya ji chọpụta nwa ọhụrụ ahụ. Mana otu nkịta nọ na Thailand eme na ihe a ga-eji tuo nkịta ugo na mba ụwa niile. Akụkọ kwuru na nkịta a zọrọ ndụ nwa ọhụrụ mama ya dị afọ iri na ise liri na ndụ n'otu ama na mba ahụ. Nne nwa ahụ liri nwa ahụ na ndụ makana ọ chọghị ka nne na nna ya mara na ọtụtara ime nkpuke. Kedụ ka nkịta si zọpụta nwa ọhụrụ ahụ? Nkịta a aha ya bụ Ping pong bia na-agbọ ụja ma na-egwu ana. Onye nwe ya wee chọpụta ụkwụ nwa na-agba tịka tịka n'ana ebe abụ Ping Pong na-egwu. Ndị agbataobi kpọọrọ nwa ọhụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ ebe ndị dịbia bekee kwuru na nwa ahụ dị Sam. Akpụpụla nne nwa ọhụrụ ahụ n'ụlọikpe mana nne na nna ya kwuru na ha ga-elekọta nwa ahụ ọmụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-49904197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49904197,Lion Heart: Ejije Genevieve Nnaji wepụtara nwere ike ituru ugo 'Oscar',Ihe ejije nke nwaada Igbo bụ Genevieve Nnaji mepụtara aha ya bụ 'Lion Heart' nwere ike ituru ugo 'Oscar'.,"Akụkọ dị mkpa: Lion Heart bụ ejije izizi Gnevieve Nnaji mepụtara n'onwe ya. Otu a kpọrọ 'Nigerian Oscars Selection Committee' (NOSC) bụ ndị họpụtara ejije a ka o soro na ndị a ga-atule maka nturuugo 'Oscar'. 'Lion Heart' bụ ejije maka onye ọgaranya nwere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọala. Mgbe ụlọọrụ ahụ chọrọ imechi n'ihi ụgwọ ha ji otu ụlọakụ, ada ọgaranya ahụ gbalịrị ike ya iji hụ na-emechighi ya. Nollywood: 'Ihe nkiri Igbo ga-abụ egwu eji site na ntuziaka m na-eweta' - Ikeagwu Otu n'ime ihe mmụta dị n'ejije a bụ na nwanyị bụ ihe. Ndị a ma ama dịka Genevieve Nnaji, Pete Edochie, Nkem Owoh, Onyeka Onwenu, Kanayo Kanayo, Kalu Ikeagwu na oti egwu Phyno socha mee ya bụ ejije. Buhari agaala Saụt Afrịka Buhari n'ime ụgbọelu o ji aga Saụt Afrịka Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjiria taa bụ Wenezde gawa Saụt Afrịka. Njem a bụ ka ya na onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa tinye ọnụ n'okwu gbasara 'Xenophobia'. Ndị so Buhari mee nje m gunyere gọvanọ Kano steeti, Umaru Ganduje, Dave Umahi nke Ebonyi nakwa Simon Lalong nke Plateau. Cheta na ndịisiala abụọ ahụ bu ụzọ zigara onwe ndị ozi gbasara ya bụ okwu. A na-atụ anya na nzute Buhari na Ramaphosa ga-eweta okwu ịkpa oke agbụrụ n'isi njedebe maka na o si taa dịwa mma ọ dịwara gboo. Ọzọkwa Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla okwu na-efegharị na ọ na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ O si n'aka onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuo na o nweghi mgbe ọ kwadoro ịgbanwe iwu ala ma kwuo na ọ ga-arịtu n'okwa mgbe oge ya gwụrụ n'afọ 2023. Tambuwal na Ganduje enwetala mmeri Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje Ụlọikpe ntuliaka na Kano Steeti eweliela gọvanọ Umar Ganduje aka elu. Ha kwuru na ọbụ Ganduje tuuru ugo n'ezie na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'ọnwa Mach afọ a. Gọvanọ Aminu Tambuwal N'otu aka ahụ, ụlọikpe ntuliaka nke Sokoto steeti kpebikwara na ọbụ Aminu Tambuwal meriri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ taa. Ikpe ahụ dị n'etiti gọvanọ Aminu Tambuwal nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na Ahmed Aliyu nke otu 'All Progressives Congress'. N'Enugwu, Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu Ndị uweojii na steeti ahụ anwụchiela mmadụ iri na ise bụ ndị na-echụ ndị steeti ahụ ụra site n'akparamagwa dị icheiche. Ụfọdụ ihe anatara ndị a bụ egbe anọ, ụgbọala atọ nakwa ekwentị iri na atọ. N'ofesi Mba Amerịka amachiela ntụbata ọla dayamọnd site n'obodo Zimbabwe. Iwe ha bụ na Zimbabwe na-amanye ndị mmadụ amanye ịrụ ọrụ n'ebe a na-egwuputa 'diamond' ndị ahụ. Mana ndị ọchịchị Zimbabwe kwuru na Amerịka asigbuola onwe ha n'asị, maka na onweghị onye ha manyere ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ. Jamal Khashoggi Jamal Khashoggi Taa ka o mere otu afọ e ji gbuo Jamal Khashoggi onye ntaakụkọ si mba Saudi Arebia. N'ụbọchị Wenezdee, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ embasi ndị Saụdi Arebia nke dị na mba Tọkị. Ọ bụ n'ime embasi ahụ ka a nọ gbuo Khashoggi n'afọ gara aga. Hatice Cengiz, onye Khashoggi chọbụrụ ịlụ, na-akpọ oku ka ejide ndị gburu ya ma maa ha ikpe. A na-ebo ọkparaeze ndị Saudi Arebia bụ Mohammed bin Salman ebubo na aka ya dị n'ọnwụ Khashoggi. Mana ọ gọrọla ọnụ ya na aka ya adịghị ya. Ọkparaeze Harry agbarụọla ihu Ọkparaeze Harry eforola ntụtụ taa n'ihe gbasara nwunye ya bụ Meghan Markle Ọ kọwara na ọ ga-akpụpụ ụlọọrụ mgbasaozi Mail on Sunday ụlọikpe iji gbochi ihe mere nne ya bụ Lady Diana ịme nwunye ya. N'egweregwu Asọmpi UEFA Champions League ka na-agakwa n'ihu. Otu egwu bọọlụ Liverpool, Chelsea, Barcelona, Inter Milan na ndị ọzọ ga-apịrị ya n'abalị taa N'asọmpị nke ụnyaahụ, Bayern Munich ji goolu asaa asatara abụọ saa Tottenham ahụ. Manchester City meriri Dinamo Zagreb 2-0, Real Madrid na Club Brugge gbara onwe ha 2-2. Okwu Tammy Abraham na Fikayo Tomori Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Aka na-achịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr agwaala BBC na ọ gaghị etinye ndị ọgba bọọlụ abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori n'otu Naịjirịa ugbua. Abraham na Tomori bụ ndị ọgba bọọlụ a mụrụ na mba Ingland agbabugoro England bọọlụ mbụ. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo ga-amasị gị: Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?" afirika-51350144,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51350144,"""Donatus Nwamkpa erubeghị ogo anyị ịsa ya okwu"" - Ọnyeozi Abaribe",Ọnụ na-ekwuru Enyinnaya Abariba bụ Uchenna Awom asaala Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche otu All Progressives Congress (APC) n'Abia steeti okwu ọ gwara onyeisi ya.,"Onweghị ihe ndị DSS kwuru maka nwụchị Abaribe ruo ugbua Uchenna sị na Donatus erughi onye ha ga-asa okwu maka na ya na Abaribe ahaghị. Uchenna sị na ""okwu Abaribe kwuru kemgbe abịlị olemole gara aga ka Nwamkpa tetere ura taa bia ikwu."" O kwukwara na Abaribe kwuru okwu dị ka onyeisi pati nke nta n'ụlọemeiwu nke Bekee kpọrọ Minority Leader; na o rughiri Abaribe na Nwamkpa ịsakọrịta okwu. Akwụkwọ akụkọ Vanguard buru na Onyeisioche pati APC n'Abia Steeti bụ Donatus Nwamkpa gbara omeiwu Enyinnaya Abaribe ụkwụ n'ihi oku ọ kpọrọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị. Nwamkpa kwuru na ọ bụ Abaribe kwesịrị iritu n'oche Sịnetọ n'ihi na onwebeghi ihe a na-ahụ anya o mepụtara kamgbe afọ iri na atọ ọ bụụrụ onye omeiwu. O kwuru nke a na nzahachi okwu Sinetọ Abaribe kwuru n'ọgbọ ụlọomeiwu n'izu gara aga bụ ebe ọ kpọrọ oku ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị maka amaghị eme gọọmenti ya ọkachasị na nchekwa obodo. Nwamkpa bụ onye gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Isochi dị n'Umunneochi nke Abia steeti kpọrọ Abaribe oku ka ọ depụta ihe ọ rụpụtaara ndị ọ na-anọchi anya ha kemgbe ọ malitere ọchịchị afọ iri na atọ gara aga. Ekwenti Nwamkpa agaghị aga ịmata ma ya bụ okwu esi na n'ọnụ ya n'ezie. Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49109179,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49109179,Ministerial Screening: Ụfọdụ ihe ịrịbaama mere na nhọpụta ndị ọchịchị e mere n'ụlọomeiwu ukwu,Ihe mbụ gbagwojuru anya bụ na nwaanyị mbụ bịara ya bụ nnyocha bụ Sharon Ikeazor sị Anambra steeti enweghị ajụjụ ajụrụ ya.,"Chukwuemeka Nwajiuba Sharon Ikeazo Kama ha sị ya gbuchapụrụ ndị omeiwu gawa maka ọ bụ nwaanyị n'ihi na ihe nwaanyị na-adị ha mma. Onye ọzọ kpara ụka ọchị ebe ahụ bụ Dede Rochas Okorocha bụ onye juru Olamilekan Adegbite nke Ogun steeti ihe ọ ga-eme ịweta obi aṅụrị na Naịjirịa ọkachasị ugbua obi aṅụrị kọrọ ụkọ n'ala a. Cheta na Rochas Okorocha hibere ministrị na ahụ maka obi aṅụrị mgbe ọ bụ gọvanọ Imo steeti. Ihe gbasara obi aṅụrị na-echu ya ụrọ. Nwaamadị ọzọ jụrụ ajụ atụghị anya ebe ahụ bụ Ewhrudjakpo Lawrence bụ onye juru sị ""ụgbụa gọọmenti etiti kwusigoro ịta akpụka anụ bụ kanda, bụ nke na enya ha obi aṅụrị, kedụ ụzọ ọ ga-esi wete obi aṅụrị n'ụlọ ndị mmadụ?"" Ndị mmadụ kwachakwara ọchị na ya bụ ajụjụ. Nke ọzọ bụ Enyinnaya Abaribe gwara Godswill Akpabio na-enwezụga na ha kwekọrịtara na onye bụbu onye otu ha ga-egbuchapụrụ ha na-azaghị ajụjụ ọbụla, na ya kara ịme ya ka ọ gbaa ọsịsọ. Ndị Sineti gwakwara Rotimi Amechi ankwa George Akume ha gbuchepụrụ ha gaa ihu na-azaghịa ajụjụ ọbụla. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51186866,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186866,Nigerian Weddings: 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a',Isa Sulaiman Panshekara dị afọ 26 chọrọ ịlụ Janine Sanchez bụ nwaanyị Amerịka dị afọ 46 gwara BBC na o nweghi ike ịhụ nwaanyị Naịjirịa n'anya ka ọ nụchara ụtọ nwaanyị a.,"Gịnị kpatara nke a? ""Eziokwu bụ na ụmụnwaanyị anyị amaghị ihe bụ ezigbo ịhụnanya, ma ọ bụghị na ha na-achọ ihe n'aka gị, ọ bụrụ na ogbu oge nwere 'plan'. Mana nwaanyị onye ọcha gwa gị na ọ hụrụ gị n'anya, nwanne, o si ya n'ala ala obi."" Isa bụbụ ọkpụisi kwuru na obere ụjọ bara ya ahụ mgbe ndị Hisbah na ndị ọrụ nchekwa DSS kpọtara ya n'ụlọọrụ ha, mana ọ garuru ọ bụrụ ndụmọdụ ka ha nyere ya n'ihi etu ndị ntaakụkọ si ebugharị akụkọ ya. Isa na Janine zutere onwe ha n'Instagram ebe otu afọ gara aga. ""Anyị zutere mgbe m malitere iso ya n'elu Instagram, o tinye foto ya m binye ya aka mmasị m. Mgbe obere oge gatụrụ, m bịa hụ na ụfọdụ ndị a na-eme 'Yahoo yahoo' na-achọ igwu ya chandum, m bịa zigara ya ozi sị ya gbachikwa ndị ahụ nkịtị. ""Nke ahụ abịa mee ya ka ọ hụ na mbụ onye buuru ya ihe ọma n'obi. Ọ bụ nke a mere ka ọ malite inwe mmasị ebe m nọ mgbe ahụ. ""Anyị si ebe ahụ malite ịkpa ọfụma, na-akpa nkata site n'onyonyo nke ekwentị. Nke ahụ niile kpọtara anyị ebe anyị nọ ugbua."" Ịza ajụjụ a jụrụ ya ma ha abụọ ehiela n'otu imeụlọ kemgbe Janine chọrọ ya bịa Kano ụbọchị isii gara aga, o kwuru sị: ""Anyị anaghị araghụ n'otu imeụlọ, mụ na ya na-anọgide chi ejie tupu m sị ya ka chi foo. Naanị nke obere a anyị na-eme (ịmakụ onwe anyị na ijide aka) ndị mmadụ na-ekwu okwu ka ọ fọdụzịa ịlaba n'otu imeụlọ."" Isa kwuru na ezinaụlọ ya ekwetela ka ọ lụọ Janine, nke bụ na ha ga-agba akwụkwọ na Maachị afọ 2020 a, tupu ya na nwunye ya akwakọrọ lawa mba Amerịka. ""Anyị gbachaa akwụkwọ n'ọnwa Maachị site n'amara Chineke, anyị ga-ala mba Amerịka ebe m ga-achọta ọrụ, laghachị ụlọakwụkwọ, makana m kwụsịrị na sekọndrị. Ebukwa m n'obi ịchọta otu egwuregwu m ga na-agbara."" Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu Janine na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mbụ ya ịbịa Afrịka, ma kwuo na obi dị ya ụtọ maka etu ndị mmadụ si eleta ya. O kwukwara sị: ""Ezutela m ihe karịrị mmadụ 100 n'ime ezinaụlọ ya, obi na-atọ m pọlịna pọlina na ha niile ekwekọrịtala ka anyị lụọ. Ọtụtụ n'ime ha ahụtụbeghi nwaanyị ọcha, ha bịara na-emetụ ntutu m aka, na-ejide m aka."" Janine bụ osiite na Kalifonịa sị na ọ na-alaghachị Amerịka na Febụwarị tupu ọ lọghachị na Maachị maka agbamakwụkwọ ya. ""M na-alaghachị azụ n'ọnwa na-abịa, m ga-alọghachịte na Maachị maka agbamakwụkwọ anyị tupu mụ na ya akwakọrọ laghachi Amerịka."" Na ngwụcha, Isa sị na ịhụnanya ya na Janine gosiri na ịhụnanya ziri ezi ka dị n'elu soshal midia, ma gwa ndị mmadụ gaa nwaa ike ha. Ihe nkiri a ga-amasị gị: I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??" afirika-49000847,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49000847,Eze Imo: O nweghị onye na-akwanye m ọkụ n'ike ka m chutuo Eze Ohiri - Ihedioha,Gọvanọ Imo Steeti bu Emeka Ihedioha akọwaala na o nweghị onye maọbụ ndị na-acha ya ọkụ ka ọ chutuo Eze Samuel Ohiri dịka onyeisi otu ndị eze ọdinala.,"Emeka Ihedioha Akụkọ na-efegharị na-ekwu na Ihedioha nwere ike iwepụ Eze Ohiri n'ọkwa n'ihi ọkụ ọtụtụ ndị mmadụ na-acha ya. Mana Steve Osuji, bụ ọnụ na-ekwuchitere Ihedioha, gwara BBC Igbo na akụkọ ndị ahụ bụ asi asi. Osuji kọwara na ndị eze biara kelee gọvanọ abalị abụọ gara aga ma riọ ya ụfọdụ ihe. ""Gọvanọ gwara ha na ya ga-eleba arịrịọ ndị ahụ anya."" ""Kedụzi nke bụ ikwanye ya ọkụ n'ike?"" Rochas Okorocha chuturu Eze Cletus Ilomuanya dịka onyeisi ndị Eze Imo Steeti n'ọnwa June 2011, ma họpụta Eze Sam Ohiri ka ọ nọchie ya Osuji gara n'ihu kwuo na o nweghị mgbe ndị eze ahụ jiri buru akwụkwọ ngagharịiwe bịa ịhụ gọvanọ. ""Onwekwanụghị mgbe ndị mmadụ ji mee ngagharịiwe n'obodo maka ihe gbasara Eze Imo."" ""Ya bụ na o nweghi mmanye ọbụla dị gọvanọ n'ahụ maka nke a."" Cheta na Rochas Okorocha chuturu Eze Cletus Ilomuanya bụbu onyeisi ndị Eze Imo Steeti n'ọnwa June 2011, ma họpụta Eze Sam Ohiri ka ọ nọchie ya. Gbasara onyeisi ụlọakwụkwọ Imsu Akụkọ kwukwara na ndị mmadụ na-amanye Ihedioha ka ọ chutuo onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Imo steeti bu ọkammụta Adaobi Obasi. Mana Osuji kọwakwara na akụkọ ahụ bụ asị. Rochas Okorocha O kwuru na Obasi na ndị isi Imsu ndị ọzọ biakwara kelee Ihedioha abalị abụọ gara aga. ""Onweghi mgbe e ji kwute okwu maka ịchụ onye ọbụla n'ụlọakwụkwọ ahụ n'ọrụ."" Obasi na aka chịburu steeti Imo bụ Rochas Okorocha bụ otu ebe ka ha si. Ha abụọ bụ ndị Ogboko n'okpuru ọchịchị Ideato South. Akụkọ ga-amasị gị: Prof Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ" afirika-51516526,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51516526,Anambra state: Ịgụ-Arọ Ndị Igbo kpọtụrụ tata na Nri,Eze Nri Obidiegwu Onyeso mere emume ịgụ Arọ ndị Igbo nke na-amalite afọ ọhụrụ n'ọnụọgụgụ afọ n'ala Igbo.,"Ọ bụ n'obi ya ka e mere ya bụ emume taa bụ Satọde, ụbọchị 15 nke ọnwa Febrụwarị 2020. Igụ Arọ n'omenala Igbo bụ mmemme eji amalite ịgụwa afọ ọhụrụ, ma malitekwa ịkọ ugbo na ịzụ ahịa ọhụrụ dịka omenala Igbo gbo gbo siri dị. Ya bụ mmemme bụ nke ndị Nri na-eme kwa afọ dịka ndị kwuru na ha bụ isi omenala Igbo. Eze Nri bụ Obidiegwu Onyeso gbara afọ 32 n'oche Eze bụ onye nwa ya bụ Reagent Prince Ikenna Onyeso nọchitere anya ya gụrụ ya bụ afọ na nnọchite anya ndị Igbo niile. Na Obi Eze Nri, ndị Eze Obodo dị iche iche na ndị omenala zukọrọ were gọọ ala dịka ndị nnanna anyị ha siri mee ya ma nyekwa ndị ọrụ ugbo akụkụ ubi ha ga eji wee malite ya bụ afọ ọhụrụ. Dịka ọ na-agọ ya bụ afọ Eze Ikenna Onyeso kpeere ndị Igbo ekpere ka afọ ọhụrụ 2020 diri ha na mma. President General Ohaneze ndị Igbo bụ Chief Nnia Nwodo bịakwara ya bụ mmemme igụ arọ. Lee ka o si gaa n'uju ya Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ama m na chim ga-enye m di nke m - Nwaanyị lụru di na nka Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50744205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50744205,"Aisha Buhari, Patience Jonathan na nwunye onyeisiala ndị ọzọ ị gaghị echefu ọsịsọ","Oche nwunye onyeisiala na-adịkwa mkpa dịka nke onyeisiala, nke mere na ọtụtụ oge, okwu si ha n'ọnụ pụta na-ebu 'weight'.","Dịka nwunye onyeisiala, ụfọdụ ndị nwereike iji ihe ndị si gị n'ọnụ pụta na-atụnyere ọchịchị di gị. Nke a apụtala/pụtara ihe n'ọchịchị ndị dịka Muhammadu Buhari, Goodluck Jonathan na Turai Yar'Adua, ebe okwu nwunye ha gbara ọtụtụ ndị gharịị. Lee ihe ndị ị nwereike iji echeta ndị nwunye onyeisiala ndị a: Aisha Buhari: Aisha Buhari a mụrụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Febrụwarị, 1971 bụ nwunye Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'oche ọchịchị Naịjirịa nke ugboro abụọ ugbua. Oge ha malitere ọchịchị n'afọ 2015, e kwuburu na agaghị enwe ihe ọbụla dị ka ""ụlọọrụ nwunye onyeisiala"", mana nke ahụ gbanwere n'ọnwa Juun 2019 mgbe o kwuru sị kpọwazịkwaa ya 'first lady'. A bịa n'ikwuputa okwu banyere ọchịchị, o jighikwa ya n'ọnụ makana ọtụtụ oge ka o kwuputarala ihe na-eme n'ọchịchị di ya; o bola nwanne di ya bụ Mamman Daura ebubo ịpị di ya ka 'remote'. Ihe ọzọ tụrụ ndị mmadụ n'anya bụ etu o si kwuo na Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru di ya anaghị arụ ọrụ e dinyere ya. Buhari bụ di ya ekwuola na Aisha ekwesịghị itinyere ya ọnụ n'ọchịchị, na ọ bụ n'ime ụlọ ka ọ kwesịrị inwe ọnụ. Patience Jonathan: Patience Jonathan a mụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 1957, bụ nwunye Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa site n'afọ 2010 ruo 2015. Oge ha nọ n'ọchịchị, onye ọbụla ma na ọ naghị eji Jonathan egwu egwu, ọkachasị maka etu ọ na-esi agbachitere ya ọgụ ma ndị mmadụ kpụkarịa ya n'ọnụ etu na-adịghị mma. N'onwe nke ya, 'Mama P' bụ ihe ndị mmadụ na-akpọ ya, metara ihe ndị e ji echeta ya. Ị nwereike ichefu ""Chai! There is God oo"" bụ akwa o bere mgbe ọ na-ekwu maka ụmụakwụkwọ ndị Boko Haram tọrọla? Ka ọ bụ mgbe o kwuru na ""unu tụnyere Buhari na ntuliaka, o merie, unu ga na-aga eleta di unu n'ụlọmkpọrọ"" ka ha gara ọgbakọ ebe a na-arịọ vootu n'afọ 2015? Onye ọbụla ma ụdịrị ike nwaanyị Rivas steeti kpara oge ha nọ n'ọchịchị. Kwa mgbe ka a na-echeta ya ugbua, ọkachasị mgbe gọọmentị tụlitere okwu nnyocha ego ole ha sị na ha butere n'ọchịchị ha. Turai Yar'Adua: Turai Yar'Adua a mụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị 1957, bụ nwunye Umaru Musa Yar'Adua chịrị Naịjirịa site n'afọ 2007 ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2010. Oge ha nọ n'ọchịchị, ndị mmadụ na-ekwu na o so na ndị di ya na-ege ntị tupu o mee ihe ọbụla, dịka iwe mmadụ n'ọrụ. N'ihi ụdịrị ike a na-ekwu na nwaanyị a kpara, akụkọ kwuru na oge di ya nwụrụ, na o kwuputaghị ya n'oge maka na ọ chọrọ ihazicha ihe tupu ọ pụọ n'ọchịchị. Stella Obasanjo Stella Obasanjo a mụrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Nọvemba 1945, bụ nwunye Olusegun Obasanjo chịrị Naịjiria site n'afọ 1999 ruo 2007. Tupu ya na di ya abanye n'ọchịchị, o so na ndị ọnụ na-eru n'okwu banyere ime mkpesa maka mgbanwe ọchịchị nke Bekee kpọrọ ""political activist"". Oge ọ dị ndụ, ọ bụ nwaanyị na-etiputa 'style'. Ọ na-eke ekike mere o ji achakapụta n'ọha. Obasanjo chịzuru afọ abụọ ya n'agbanyeghi na nwunye ya nwụrụ n'afọ 2005. Ọ nwụrụ ka ọ gara ịwa ahụ nke a kpọrọ 'plastic surgery' na Bekee. Maryam Abacha Maryam Abacha a mụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Maachị 1945, bụ nwunye Sani Abacha chịrị Naịjiria site n'afọ 1993 ruo 1998. Abacha chịrị oge Naịjirịa ka nọ n'okpuru ọchịchị ndị agha, mana ọchịchị ya adabaghịrị ndị Naịjirịa, nke mere na oge ọ nwụrụ n'afọ 1998, ndị mmadụ wụbara n'ụzọ na-amali elu, na aṅụrị. N'afọ 1999, Maryam kwuru na n'agbanyeghi ihe niile ndị mmadụ na-ekwu maka di ya, na ọ hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu. Maryam Babangida Maryam Babangida a mụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 1948 bụ nwunye Ibrahim Badamasi Babangida chịrị Naịjirịa site n'afọ 1985 ruo 1993. Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ya kewapụtara ọkwa 'first lady' na Naịjiria site n'ịbụ onyeisi ndị nwunye ndị agha, ebe o si wee hibe ọtụtụ ihe na ụlọọrụ na-enyere ụmụnwaanyị aka. O mere ihe mere ọha ji buru ya n'isi ghara ị na-akatọ maọbụ ekwutọ ya; ọ bụghị naanị na Naịjirịa, ma na mpaghara Afrịka dị iche iche. Dịka nwunye onyeisiala, ekike ọ na-eke bụ 'Igbo bịa lelee"", nke bụ na ọ bụ 'olu gbajie ọha'. Nna ya bụ onye Igbo si Asaba, ebe nne ya bụ onye Awụsa. Ọrịa Kansa gburu ya n'afọ 2009. Kedụ nke kacha masị gị? Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: N'etiti nwoke na nwaanyị kedụ onye ka eghewe ahụ oghe n'ejije ha?" afirika-44235075,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44235075,Ndịagha wakporo ụmụnwannyị na-gba ọsọ ndụ n'ike - Amnesty,Ndị na-ahụ maka ikike onwe nke akpọrọ Amnesty International ekwuola na ndị agha Naịjirịa na-awakpo ụmụnwaanyị na-agba ọsọ ndụ n'ike n'ọwụwa anyanwụ n'ugwu Naịjirịa.,"Ndị awakporo be ha na Borno n'afọ 2015 N'ime akwụkwọ ọhụrụ ndị Amnesty dere, ha sị na ndị agha Naịjirịa wakporo ụmụnwaanyị a ka ha nọ n'ebe ndị gbara ọsọndụ na-anọ na Borno steeti. Ha Kwụrụ ndị agha a jiri ahụhụ dị n'ebe ahụ were rata ụmụnwaanyị ha wakporo. Ndị Amnesty kwurụ na ụmụnwannyị itoolu bụ ndị kwuputara ihe ndị agha mere ha. Otu n'ime ha sị ""Ị ga-ahụ onye agha ji ihe oriri n'aka ga-agwa gị: ""Ị hu m n'anya, were nrị a."" Ha ga-asịkwa: 'soro anyị, nke ga-eme ka anyi che maka ụmụ anyi na-ebe akwa maka nrị. Ị nata nrị ahu, ọ ga alaghachịte ka gi na ya nwe mmekọrịta, ya bụrụ na-ikweghị, ọ wakpo gị n'ike."" Otu onye na ekwuchịtere ndị agha Naịjirịa katọrọ akwukwọ ndị Amnesty dere, na-ekwu na okwu mwakpo a akwụghi ọtọ. Ndịagha Naịjirịa n'ọrụ nchekwa na-ibuso ndị Boko Haram agha na ọwụwa anyanwu nke ugwu Naịjirịa Ndị Amnesty na onwe ha na-akpọ ndị mba Briten ka ha hazigharịa mmekọrịta ha na ndị agha Naịjirịa. Mana ndi mpaghara gọọmentị Briten na-ahụ maka nchekwa sị na ha na npaghala ndị agha Naịjirịa a na-ebo ebubo a. Ndị Amnesty nakwa asị gọọmentị Naịjirịa ka ọ tinye anya na okwu a. Nke a abụghị nke mbu Amnesty na-ebo ndi agha Naịjirịa ebubo, mana onwebeghị nke ha na-ekwe na ha mere. Akwụkwọ ewepụtara n'ọnwa Eperelụ nke afọ gosiri na ihe ruru mmadu nde 1.8 gbara ọsọ ndụ maka mkpam mkpa ndị Boko Haram na agha ndị agha Naịjirịa na-ebụso ha. Akụkọ ga-amasị gị:" 43651610,https://www.bbc.com/igbo/43651610,'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwụkwọ isi dara iwu',Ndị mmadụ jisike na-egosi iwe ha n'elu atụmatụ mgbasa ozi nke a kpọrọ Twitter maka akụkọ pụtara ebe otu mahadum bu Covenant kpụrụ ụmụakwụkọ ha isi.,"Ụmụakwụkwọ mahadum ahụ enweghị ikike iji ekwenti ga ebe ahụ Ụmụakwụkwọ a na-ekwu na ihe kpatara eji kpụ ha isi bụ maka na ha ejighi akwụkwọ nsọ ga na chapụl ha n'ime ụlọakwụkwọ ahụ. Otu onye ọkaikpe bụ Precious Nwankwo gwara BBC Igbo na ndị isi n'ụlọakwụkwọ ahụ dara iwu na-ahụ maka nchekwa oke ruru mmadụ. Gee ntị ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju: 'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwkwọ isi dara iwu' Otu onye si na mahadum ahụ pụta achọghị ka-enye aha ya sị na nke a bụ obere ihe n'ihe ndị ọzọ mahadum ahụ na-eme ụmụakwụkwọ ha. Ọ sị: ""mahadum ọ bụla nwere ihe dị njọ na ihe dị mma maka ya, nke a a gaghị a pụ iche"". Mbọ BBC gbara inweta Mahadum Covenant ka ha sa ebubo amịtaghị mkpụrụ. Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọrọ onye registra madadum n'ekwenti, o kwuru na ya enweghị ọsisa ọbụla. Nwata akwụkwọ ochie ahụ kwukwara na ụmụakwụkwọ ahụ kwesiri ị wetu obi gụọ akwụkwọ si ebe ahụ pụọ. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu social media gbasara akụkọ a: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43324997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43324997,A tụọla Charles Okah nga mkpụrụ ọka,"Ụlọikpe etiti dị n'Abuja tụrụ Charles Okah bụ onye tụrụ ogbunigwe na mbara Eagles Square dị n'Abuja ụbọchị Oktoba 1, afọ 2010 dịka a na-eme ncheta ụbọchị nnwereonwe Naịjirịa.","Kemgbe afọ 2010 ka e bidoro ikpe Charles Okah E kpebiri ikpe Charles na onye otu ya bụ Obi Nwabueze taa. E kwuru na mmadụ abụọ ahụ a mara ikpe kpara nkata ịtụ ogbunigwe ahụ, ha na nwanne Charles bụ Henry Okah. Henry Okah bubu onye ndu otu ndị Niger Delta bụ Movement for the Emancipation of Niger Delta na bekee. A tubuola Henry nga afọ iri abụọ na anọ n'afọ 2013 n'ụlọikpe dị na South Africa. Onye ọkaikpe bụ Gabriel Kolawole oge ọ kpebiri ikpe ahụ taa kwuru na onye kpụpụtara Charles na onye otu ya n'ụlọikpe kpegburu ha nke ukwu. A turu ha mkpọrọ ndụ dịka iwu ndị EFCC bụ ndị kpụpụrụ ya ụlọikpe nyere ikike. Oge mbụ a kpụpụtara Charles na Nwabueze nakwa Edmund Ebiware na Tiemkemfa Francis-Osvwo n'ụlọikpe bụ ụbọchị 7 ọnwa Disemba afọ 2010 maka ogbunigwe a tụrụ n'Abuja ụbọchị ncheta nnwereonwe naka nke a tụrụ na Warri. Francis-Osvwo nwụrụ n'ebe e ji ya ebe ekpebiri ikpe Ebiware ụbọchị Jaenuwarị 25 afọ 2013 maka otu arụ ahụ. Ihe ruru mmadụ iri na abụọ nwụrụ site n'ogbunigwe ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ gunyere ụgbọala ndị gbara ọkụ ụbọchị ahụ ihe ahụ mere na mbara Eagles Square dị n'Abuja ebe mmemme ncheta nnwereonwe Naịjirịa nọ na-akpọtụ. Oge ahụ, onye na-achị bụ Goodluck Jonathan. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43180435,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43180435,Mwakpo Yobe: Ụmụakwụkwọ 105 na-efu na Dapchi,"Ụmụakwụkwọ otu narị na ise ka na-efu n'ime ụmụaka ndị ọmetakaraịhepụụjọ bụ Boko Haram tọọrọ na Government Girls Sceondary School Dapchi n'ụbọchị Monde,ọnwa Febrụwarị iri na itoolu.","Ndị ọmekatara tọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị na Dapchi Yobe steeti Akụkọ kọrọ na ọtụtụ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ gbabara ọhịa ize ndụ. Mana egwu bara ndị nwe ha ahụ ebe ụmụaka ahụ a lọtaghị kamgbe ya bụ ọsọndụ bere. Akụkọ ruru Agence France Presse ntị na-akọwa na ndị ya bụ ihe metụtara ehibele otu ga-enyere ha aka ịhụ n'okwu gbasara ụmụaka ahụ anyụghị ka ọkụ. Ọ sịkwa na nke a bụ ihe a mụtara mgbe a tọọrọ ụmụakwụkwọ na Chibok n'afọ 2014. Ka ọ dị ugbua, ndị otu a e depụtala aha ụmụaka ahụ na-efuefu. Onye na-achịkọta ya bụ otu bụ Bashir Manzo sị na ""ịhe mbụ anyị mere bụ ị depụta aha ụmụ anyị niile na-efuefu. Ka ọ dị ugbua anyị edetuola aha mmadụ dị otu narị na ise."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Manzo, onye ada ya nwaanyị bụ Fatima so na ndị a na-achọ achọ sịrị na ndị otu ahụ ga- ahụ Gọvanọ steetị ahụ bụ Ibrahịm Gaidam. Ọ sịrị na ya na-eche na a kọwatachaghịrị ya ihe mere nke ọma mgbe o kwuru na ha a chọtala mmadụ iri anọ na asatọ n'ime ụmụaka ahụ na-efu efu. Manzo kwuru na mbu, na ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ na-agọ ma ka na-agọsịkwa ike na ọnweghị ndị furu efu na ya bụ ụlọakwụkwọ. Manzo kwuru na ""Anyị ga ahụ Gọvanọ nakwa onye ọbụla nwere ike ị nye aka, yọ ha ka ha nyere anyị aka ị hụ na atọghapụrụ ụmụ anyị n'agbụ"". Lee aha ndị a na-achọ achọ ebe a. 1. Fatima Bashir 2. Aisha Kachalla 3. Zainab Abubakar 4. Falmata Wakil 5. Fatima Isa 6. Fatima Musa 7. Aisha Usman 8. Aisha Adamu 9. Fatima Isa 10. Hauwa A. Mohammed Idriss 11. Maryam Mohammed 12. Fatima Mohammed II 13. Hauwa Salisu 14. Hassana Gambo 15. Aisha Adamu 16. Adama Garba 17. Zara Grema 18. Maryam Daamkontoma 19. Zainab Bama 20. Fatsuma Abdullahi 21. Fatima Yahaya Tarbutu 22. Amina Yahaya Tarbutu 23. Amina Adamu 24. Hajara Ali 25. Fatima Abdullahi 26. Fatsuma Ali 27. Zara'U Mohammed 28. Salamatu Garba 29. Falmata Alh. Inuwa 30. Falmata Alh. Ali 31. Aisha B. Danjuma 32. Maryam Bashir 33. Maryam Aliyu Mabu 34. Fatima Modu Bamba 35. Aisha Modu Bamba 36. Hafsat Haruna 37. Rabi Alh. Nasiru 38. Hadiza Moh'D 39. Fatima Aji Hassan 40. Falmata Wakil 41. Aisha Wakil 42. Falmata A. Audu 43. Aisha Maina 44. Aisha Mohammed 45. Aisha Mamuda 46. Name missing on list 47.Zainab Usman 48. Hadiza Mohammed Taiduma 49. Maryam Ibrahim 50. Fatima M. Gira 51. Hafsat Ibrahim Gira 52. Maryam Ibrahim 53. Zara Tijjani 54. Amina Haruna 55. Fatima Adamu 56. Khadija Mai Sale 57. Khadija Ali 58. Habiba Musa Jakana 59 Fatima Bukar 60. Hajara Gidado 61. Maryam Basiru 62. Fatima Usman 63. Maryam Ibrahim 64. Leah Sherubu 65. Aisha Alh. Deri 66. Fatima Hassan Mustapha 67. Zainab Manu 68. Zara Tijjani 69. Zainab Bukar Abba 70. Hauwa Saidu Abubakar 71. Karima Inusa 72. Amina A. Abubakar 73. Yakura Sani 74. Rabi Yahaya Tela 75. Hajara Yahaya Tela 76. Marya Mustapha 77. Aisha Abdullahi 78. Maryam Adamu Mohammed 79. Bintu Usman 80. Fatsuma Mohammed 81. Salamatu Isiyaku 82. Hauwa Lawan 83. Aisha B. Danjuma 84. Aisha Moh'D Jakusko 85. Hauwa Bulama 86. Fatima Abubakar Jambo 87. Walida Adamu 88. Fanna Mohammed 89. Aisha M. Bukar 90. Maryam Usman 91. Aisha Abba Aji 92. Maryam Usman 93. Maimuna A. Hassan 94. Zara Musa 95. Maryam Mohammed Kaku 96. Khadija Suleiman 97. Habiba Nuhu Dan Inu 98. Fatima Isiyaku Aliyu 99. Sahura Jibir Mohammed 100. Khadija Grema Dabuwa 101. Zara Grema Dabuwa 102. Zara Mohammed Lawan 103. Fatima Mohammed 104. Fati Modu Aisami 105. Fatsuma Alli. Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru, ụnyaahụ bụ Eke na ihe mere ụmụaka ahụ dị omiiko. Ọ sịrị na ya bụ ihe bụ oke arụ megide ala Naịjirịa." afirika-43673041,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43673041,Akụkọ kachasi n'abalịa: Kanụ Nwankwọ agaghị azọ ọchịchị,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa. Njem Orji Uzor Kalu na mpaghara ọdịda anyanwụ,"Orji Uzor Kalu wụbu gọvanọ Abia steeti site n'afọ 1999 ruo 2007 Orji Uzo Kalu na Ọọnị nke Ife bụ Oba Adeyeye Enitan Ogunwusi, zukọrọ taa n'obieze ya. Kalu mere njem a iji kwado udo n'etiti ndị Naịjirịa, o kwuru na o kwenyere n'ime ndịnotu Naịjirịa. Njem a akpọgala ya n'obieze Alake nke Egbaland bụ Oba Adedotun Aremu Gbadebo nakwa Oba nke Lagos bụ Oba Rilwan Akiolu. Mbugo n'ọkwa ndị agha Naịjirịa Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere iwu mbugo a maka nkwenye siri ike na ike ndịagha gosiri ka ha na-alụ ọgụ n'ọhịa Sambisa Ndị agha Naịjirịa ebugoola ndịagha puku atọ na narị asaa na iri abụọ na itoolu (3,729) n'ọkwa. Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ndịagha na ndị mmadụ bụ Brigadier General Texas Chukwu, kwuru na ndị agha a ebugoro n'ọkwa bụ ndị otu Operashụn Lafiya Dole so lụọ agha operashụn Deep Punch nke abụọ n'ọhịa Sambisa. Ikpe Jacob Zuma E boro Zuma ọtụtụ ebubo mmerụaka Ụlọikpe amaala onye chịburu mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma ikpe. Ha mara ya ikpe maka mmerụaka n'ihe gbasara ngwaagha, mpụ na aghụghọ nakwa mbupu ego o mere n'ebe afọ 1990. Cheta na Zuma rituru n'oche ọchịchị onyeisiala n'ọnwa Febụwarị ka ndị otu pati ya kwanyere ya ọkụ n'ike maka ebubo mmerụaka. N'akụkọ egwuregwu Nwankwo Kanu so na ndị ọgba bọọlụ bulirila iko Premier League, FA, Champions League, iko UEFA ma nwetakwa medaalụ ọlaedo nke Olympic Onye gbabuuru Naịjirịa bọọlụ bụ Kanu Nwankwo, ekwuputala na ọ gaghị azọ ọchịchị na 2019. O kwuru na ọ dịbeghị nkwadobe ịzọ ọchịchị n'oge na-adịghi anya dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ siri kwuo n'izu gara aga. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Kedụ aha ụtọ ị na-etu onye ị hụrụ n'anya?" afirika-45562431,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45562431,Nigeria Air: Gọọmenti akwụsila ụgbọelu ha kwadoburu iwepụta,"Sirika depụtara n'akara Twitter ya na: ""ọ bụrụ m ihe nwute na gọọmentị etiti n'ọgbakọ 'Federal Executive Council' nwere mkpebi ikwụsị ụgboelu nke Naịjirịa bụ ""Nigeria air"".","Ụgbọelu ọhụrụ a kwesiri ebido ọru na ọnwa Decemba nke 2018 End of Twitter post, 1 ""Anyi ga-emezu nkwa niile anyị kwere. Anyi kenere ọhaneze maka nkwado ha"". Cheta na ya bụ ụgbọelu ha wepụtara n'ọnwa Jụlai iri na asatọ (23 Jụlaị) nke afọ 2018 na London bụ nke ha kwadoro iji wee wekete Obodo Naịjirịa ana Mba ụwa niile. Mgbe gọọmenti etiti kpọpụtara aha ụgbọelu a, Sirika kwuru na ""ọ ga-abụ ihe na-ewebata ego karịa ma ị bụ ihe eji e nyere ndị mmadụ aka"". ""Goọmentị etiti a gaghị e lekọta ya, ọ ga-abụ ọrụ ndị oji ego ahụ ego ị hụ maka ya."" Na akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke 2017, gọọmentị etiti wepụtara ego ruru nde narị naira 555 maka ị wepụta ya bụ ụgbọelu ma keputakwa ndị ga-ana hụ maka ya nde narị naira 200. Na nke afọ 2018, ha wepụtara nde narị naira 50 ma kepụta nde narị naira 20 maka ndị ga-ana hazi ya. Mana ọtụtụ mmadụ akatọla ya bụ ihe were na-ekwu na ọ bụ imefusi akụ na ụba Naịjirịa. Lee ihe ha na-ekwu na Twitter: @igweofficial na-ajụ gịnị mere gọọmenti etiti ji emefu ego niile a n'iwepụta ya bụ ụgbọelu ebe ọ bụ na ha ma na ha agaghị emeru ya n'isi. @ZaxmaOmar kwuru na ihe a abụghị ezigbo akụkọ makana ọ maghị ka o ga-esi saa ndị na-akatọ ọchịchị Buhari. @ileife kwuru na gọọmenti ga akwụghachi ego niile ha mefuru mgbe ha gara London ị wepụta ya bụ ụgbọelu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46047994,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46047994,Etu ndi tọọrọ ụmụ NYSC n'Imo ji danye n'aka ndi uweojii,Akukọ na-erụ anyi ntị na-akọwa na ndị uweojii n'Imo steeti nwụchiri ndị a na-enyo na aka ha dị na ndị na-efe Naịjirịa atọrọla n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọktoba a.,"Godson Orlando Ikoku bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo gwara BBC na aka kparala ndị a na-eche na aka ha dị n'ihe mere. Ṅ'ọnụ Ikoku, ndị NYSC a nọ n'ụzọ ịga zaa aha ha n'ebe oku ala nna kpọrọ ha mgbe ha zutere ndị omekome a n'isi ụtụtụ. ""Mmadụ ano n'ime ndị NYSC a bụ ndị Ọyọ steeti, ọtụ bụ onye Ọshụn Steeti. Ha na-aga Rivas na Akwa Ibom steeti ịza oku ala nna mgbe ha zutere ndị ntọ a na gburugburu obodo Ụmụakpu dị n'okpuru ọchịchi Ọhaji Egbema."" ""Ndị ntọ jidere ụgbọala ha, zuo ha ohi ma tọrọ ndị NYSC na otu onye ọzọ mana ọkwọụgbọala nwetara ohere gbaa ọsọ gbaga ebe ndị uweojii nọ nche. ""Ndị uweojii a chụrụla ndị ntọ a baa n'ime ọhịa ebe ha ji ndị a ha tọrọ ma zọpụta ha niile,"" Ikoku kwuru. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha jidere ndị a ha na-ebo na ọ bụ ha kpara ike a n'ụzọ abụọ. ""Ndị uweojii nọ ọrụ na mpaghara Nkaraha dị n'Ohaji Egbema nwụchiri ndị a n'ime ụgbọala. ""A hụrụ ihe mgba ama n'aka ha mere e ji nwụchie ha maka ịgba ha ajụjụ ọnụ ebe ha gbara ama na ọ bụ ha tọrọla ndị a na-efe ala nna n'atụmatụ Bekee kpọrọ Nation Youth Service Corps (NYSC)."" Ndị uweojii jidere ndị a bụ ndị si ngalaba 'Anti-Kidnapping Unit' nke uweojii Imo Steeti. Ndị a aka ji bụ Wisdom Nwobodo, dị afọ 22, ma bụrụkwa onye Ikwerre na Rivas steeti; Okoro Emenike dị afọ 20 sikwa Ikwere; Chukwu Wisdom dị afọ 19 ma bụrụ onye Ụmụakpu nke dị n'Imo steeti. Ikoku sị na a ga-akpụpụ ndị a ụlọikpe ma ha mechaa nyocha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43862343,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43862343,Akụkọkachasị n'ụtụtụ a: Gọọmentị e bola ndị ndọrọndọrọ ebubo,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ndị ji egbe na-egbusi mmadụ - Gọọmentị,"Ọnụ na-ekwụchitere onyeisiala bụ Garba Shehu ekwuola na gọọmentị etiti nwere ihe igbaakaebe, na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ndị ji egbe na-egbusi mmadụ na steetị dị na mpaghara etiti ugwu-awụsa. Shehu kwukwara na Muhammadu Buhari chọrọ isonye n'ịzọ ọchịchị na 2019 maka na ọchọghị ka ndị otu pati ọzọ mebie ihe ọma niile o mere na Naịjirịa kemgbe ọ batara ọchịchị na 2015. A nwụchiela Dinọ Melaye Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na-anwụchiri Sineto na-anọchite anya Kogi Centralụ bụ Dịno Melaye ka ọ na chọ ịga mba Morocco na ụtụtụ a. Melaye bụ onye kwupụtara nke a n' igwe okwu Twitter. Ọ sị: ""A nwụchiri m ugbu a dịka m nọ na ọdụ ụgbọelụ Nnamdi Azikiwe na-akwado ịga Morocco maka ozi nke gọọmentị etiti zigara anyị."" Ọgwụ esuula na ndọrọndọrọ ọchịchịAPC nke Abia steeti Otu abụọ na-azọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị APC n'Abia steetị anụọla nnukwu ọgụ ma merụe ọtụtụ mmadụ ahụ. Ndị nọ n'isi otu ndị a bụ Emmanuel Ndukwe na Donatus Nwankpa. Ha na-azọ ọkwa a kemgbe Emmanuel Ndukwe wetere akwụkwọ ụlọikpe chụpụrụ Donatus Nwankpa dịka onyeisi ndị APC steetị ahụ. Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị uweojii bịara ọsịsọ gboo ọgụ zọrọ ọtụtụ mmadụ imerụ ahụ. France na iwu ọhụrụ a Mba France emeputaala iwu kwuru na onye ọbụla sị azụ ụzọ bata ala ha ga-aga mkpọrọ otu afọ. Ha kwukwara na ha emeputaala iwu ga-enye ndị na-agba ọsọ ndụ enyemaka maka inweta akwụkwọ obibi n'ala ha. Mana ndị otu na-alụ ọgụ maka ikike dịrị mmadụ nke ala France kwuru na iwu nke ụlọmkpọrọ tara ezigbo akpụ. Mohammed Salah bụ onye ọgbabọọlụ kachasị Mohammed Salah onye otu egwuregwu bọọlụ Liverpool eturula ugo dịka onye ogbabọọlụ kachasị n'ime dị ogbabọọlụ n'afọ a. Salah dị afọ iri abụọ na ise enyeela ọkpụ ruru iri atọ na otu n'ime asọmpị iri ato na atọ. Mohammed Salah onye otu Liverpool eturula ugo dịka onye ogbabọọlụ kachasị n'ime dị ogbabọọlụ n'afọ a. Salah dị afọ iri abụọ na ise enyeela ọkpụ goolu ruru iri atọ na otu n'ime asọmpị iri ato na atọ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50547203,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50547203,Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu,Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'ihe dakwasịrị onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu bụ Allen Onyema dịka mba Amerịka boro ya ebubo nrụrụaka.,"Agbanyeghi na Maazị Onyema ekwuola na aka ya dị ọcha, Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa akpọrọ Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) sị na ihe mere ya si ya n'aka. Maazị Kanu kwuru okwu n'ụbọchị ụka bụ nke 25 nke ọnwa Nọvemba n'ime gbasaozi ọ na-ezigara ndị otu ya were sị na ọ bụ eziokwu na Maazị Onyema Bịafra be ya. Ọ sị ọ bụ maka ikwu okwu banyere Naịjirịa ka Onyema jir bịa. Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche ""Maazị Onyema kwuru okwu banyere ihe nwereike iso atụmatụ kwara pụọ ndị ntoroọbịa Arewa kpụ n'ọnụ mgbe ahụ. ""Anyị kwuru maka ọtụtụ ihe mana otu ihe o chefuru bụ na a bụ m onye Biafra izizi, nke mere na agaghị m erinwu aka azụ."" Kanu gara n'ihu kwuo na Maazị Onyema sị na ya chọrọ ịhụ ka udo ga-adị ka aghara igbu ndị Igbo n'ugwu awụsa. ""A sị m ya ihe ọbụla ọchọrọ ime ya gaa n'ihu mee maka mu onwe m chọrọ udo."" Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya Kanu sị na Onyema sị ka ya na ndị ya na ha so bịa see foto,. ""Asịghị m ha mba, maka dịka onye Igbo toro n'ụlọ, anyị anaghị asị ndị ọbịa anyị mba."" Maazị Kanu kwuru maka ihe Maazị Onyema gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka ha nwere. Ọ sị na ọ tụkwasara ya asị ma chuo ya ihu. Mana, ihe Maazị Onyema kwuru na ya bụ mkparịtaụka bụ na Kanu nabatara ya na ndị ha na ya so mgbe ọ gara be ya. Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu Ọ kwukwara na Kanu nabatara atụmatụ udo ya jiri bịa ma kpọnye ya nwanne ya nwoke ka o soro ga njem mmụta etu a ga-eji hibe udo na Naijirịa. Kanu agbaghaghi ihe Onyema kwuru na-abụghị ị sị na ọtụrụ asị. Lee ihe Onyema kwuru na mkparịtaụka ahụ ebe a: Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu. Lekwa ihe ndị ọzọ o kwuru na ya bụ mkaprịtaụka: Kanu sị na ọ bụ okwu ya kwuru maka Allen Onyema mere ndị Amerịka ji nyochawa ha, mana ihe BBC ma maka ya bu okwu gosiri na ọ bụghị njem taa nke ojrii bụrụ nke ọnwa ole maọbụ ole. Ọ sịkwa na Maazị Onyema mere ezigbote mmeghi n'itinye onwe ya n'ihe ọ sị ka ya aka. ""Onyema chọrọ ịmasị ndị Fulani site na-ịgwa ha na ya na Nnamdị Kanu nwere mkparịta ụka. Ọ bụ ezigbote mmeghi."" Nnamdi Kanu na BBC Igbo Ọ sị na ihe mere Onyema bụ na ndị na-achụ ya mara na ndi Ipob agaghị akwụ onye katọro ha n'azụ. Agbanyeghi ihe ndị a okwuru, Kanu gakwara n'ihu sị na ndị na-achụ Onyema adịghị achụ ọtụtụ ndị ọzọ ọ sị aka ha dị na nrụrụaka. Cheta na mba Amerịka boro Maazị Onyema ebubo n'aka ya dị na mpụ na nrụruaka. Maazi Onyema sị n'aka ya dị ọcha n'ebubo a niile a na-ebo ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: ""Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee""" afirika-49064874,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49064874,Igbo Ancient Warrior Tribes : Mba abụọ kpara ike mgbe ochie,"""Nzọgbụ nzọgbụ enyimba enyi"" . . . Nke a bụ egwụ ndị Igbo gburubguru ghọtara dị ka egwu eji akwado ime ihe siri ike.","Igbo kpara ike mgbe gboo Dị ka Igbo bụ ndị siri ike, mana enwere ufọdụ mba n'ala Igbo eji ihe ike mara. Na agbanyeghi na enweghị mgbe ndị Igbo bịakọrọ ọnụ were lụọ agha, ndị Igbo lụritara ọgụ n'etiti onwe ha ma ha na ndị agbata obi ha lukwara ọgụ. Gịnị na-akpata ọgụ n'ala Igbo mgbe ochie : a) Izọọ ala okeala/ nsogbu okeala b) Ahịa (ọ kachasị mgbere ohu) ch) Ọgụ akwuru ugwọ e) Amụma ndị nnanna f) Iguzogide ndị ọcha. Ugbua, ka anyị lee ufọdụ mba ikpara ike n'ala Igbo - Umu Ekwumaenyi : Ezza, Ikwo na Izzii - Osiri ndị Briten ike imeeri ndị Ezza n'agha Ka ha siri Bido Akụkọ mgbe ochie na akọwa na ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Ekwumaenyi sịrị mba di anya were kwata Amuzu. Akụkọ a kọrọ n'ọnu na-akọwa na Ekwumaenyi mutara Ezekuna, Noyo na Olodo. Ezekunna mụtara Ezza, Noyo mutara Izzi ebe Olodo mụtara Ikwo. Ihe mere Ebonyi ji bụrụ ""elelịa nwa ite"" Ihe mere e ji alụ nwaanyị n'ozu n'ala Igbo Njiri mara : A na-akpọkarị ha ndị 'ọgụ ukwu' n'ihi na ọgụ ha ji akọ ugbo sara mbara karia ogu ndị ọzọ n'ala Igbo. Umu Ekwumaenyi bụ ndị eji ikọ ji mara. Ha siri ike ma dịka A. E, Afigbo dere n'akwụkwo ya bụ 'Ropes of Sand', ọ kọwara na ụmụ Ekwuymaenyi , ọkachasị Ezza bụ ndị eji ịkọpụta Ji were mara ma burukwa ndị ọkachamara n'ihe gbasara agha okpuru (gorilla warfare). Ka ha sị gbasaa Akụkọ ochie kwuru na Ekwumaenyi buru amuma na ụmụ ya ga-agbasa ruo mpaghara Cross River nke taa ma ruo kwa akụkụ mmiri Benue nke dị na Benue steeti nke taa. Nsibidi: Akara ochie e jiri mara ndị Igbo Lee 'ọgbanje’ Igbo ji eme ọnụ Ohafia Egwu Ikpirikpi ọgụ ndị Ohafia Mgbe ochie n'ala Ohafia, nwoke tozuru etozu bụ onye gara agha ma gbụrụ isi mmadu lọta. Onye lọtara ya bụ agha na apụta soro ibe ya gbaa egwu Ipirikpe ọgụ bụ egwu eji mara Ohafia rụo ubochị taa. Ihe ise na-amasị Nnamdi Kanu ị maghị Ihe mere ndị Naịjịria ji enye otu ụzọ n'ụzọ iri Ka ha siri bido Akụko mgbe ochie a kọrọ n'ọnụ na-ekwu na ndị Ohafia si na Andoli were gbapụ ọsọ mgbe ha nuru mkpọtu dị ka ndị agha a na-achọ iwakpo ha. Akụkọ a kwuru na nke a mere ka otu nwoke aha ya bụ Ezeama Atita na ụmụ ya nwoke abụọ bụ Uduma Ezeama na Onyereobi Ezema jiri zọpụ njem. Onyereobi kwusiri na Abam n'ihi na nwunye ya dị ime ebe Ezeama Utita na Uduma gawara rute Ugwumgbo ebe ha kwusiri were biri. Otu a ka ụmụ ha sịrị mubaa were nweta Ohafia. Lee etu ọkụ siri gbapịa ahịa dị n'Obiagu n'Enugwu Hazigharịa ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa anyanwụ - IGP Njirimara Mgbe ochie, ndị Ohafia bụ ndị a ma ama n'ihe gbasara ilu agha na igbuisi. Ndị agbata ha bụ Arochukwu na ndị mba ọzọ na akwụ ha ugwọ ka ha luchitere ha ọgụ. Ihe a kacha jiri mara Ohafia ubochi taa bụ egwu Ikpirikpe ọgụ bụ egwu ha na-ete ma ha lọta agha iji gosi ndị nọ n'ụlọ ka ha sị mee n'ihu agha. Lee ihe onyonyo a ka ihuta etu esi agba ikpirikpe ọgụ Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị? Lee Akụkọ ga-amasị gị Aisha Buhari etinyela ọnụ n'oku ndị uweojii kpọrọ Timi Dakolo FAAN enyopuola nwoke ahụ rịrị elu ụgbọelu na Lagos Gịnị ka ị ma maka Buchi Emecheta? Amerịka enyela Imam zọrọ ndị ụka Kraist 200 ndụ nturuugo" egwuregwu-48569935,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48569935,Nigeria vs Norway: Akpọchuola Naijirịa ihu ahị France taa.,Norway ejirila ọkpụ goolu atọ sị Naịjirịa ndewo n'asọmpị iko mbaụwa ụmụnwaanyi bụ nke amalitere an France taa.,"Ụmụnwaanyị Norway gbara bọọlụ ka nwoke ebe ndị Naịjịrịa mere ka nwaanyị ha bụ ruo mgbe a lọtara ezumike ha malitere ịkpọ ganị ganị nke amịtaghị mkpụrụ ma ọlị. Goolu Norway mbụ nke sị n'ụkwụ Reiten banyere an nkeji iri na asaa (17"") ebe nke abụọ banyere na nkeji iri atọ na anọ (34"") site n'ụkwụ Utland Egwu bara Naịjirịa ahụ bụ nke gosiri n'ahụ Ohale bụ nke mere ka onye Naịjirịa goolu nke atọ na nkeji iri atọ na asaa (37""). Ka a na-eme nke a, Naịjirịa jizi mpekere akwụkwọ edo edo site n'aka Francisca Ordega na Desire Oparanozie bụ onye bu ụzọ rite ya bụ akwụkwọ ịdọaka na ntị na nkeji iri na atọ (13""). Norway ji ọkpụ atọ merie Naịjirịa mgbe alara ezu m ike bụ nke Naịjirịa enwetaghị ụsa ya rụọ mgbe egbuchiri ya bụ asọmpi. Na abalị Satọde a ka Iko mbaụwa ụmụnwaanyị biiri ọkụ na mba France bụ nke Naịjịrịa na mba 24 ndị ọzọ so na ya. Naịjirịa sọ na ikpo nke A bụ ndị bidoro ya bụ asọmpị na Stade Auguste Delaune dị na France. Naịjirịa na South Koria ga-ezuta na Wenezde n'elekere abụọ nke ihihie na Stade des Alpes, Grenoble. Spain ejirilarị ọkpụ atọ asatara oti kpọchuo South Africa ihu ahịa. Gọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48144879,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48144879,Yemi Osinbajo: Etu ndị Anambra siri nabata ya n'Eke Awka taa,Osote onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo wụchiri n'ahịa Eke Awka nakwa Ọchanja ndị dị n'Anambra steeti iji maata etu usoro 'Tradermoni' si emetụta ndụ ndị na-azụ ahịa.,"Mgbe Osote onyeisiala gara Anambra Na njem ahụ ọ gara, ọ gara leta Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfre Achebe ịkwanyere ya ugwu. Ọ malitere njem ya n'Enugwu steeti ebe aka na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Ugwuanyi nabatara ya n'ọdọugboelu Akanu Ibiam. Nghagharịiwe a na-eme n'Algeria ""Anyị agaghị agbachi nkịtị"" bụ ihe na-afịọ n'obodo Algeria dịka igwe mmadụ pụtara ịme ngagharịiwe maka ọchịchị nchịgbu n'ala ahụ. Ha kwukwara na ha chọrọ ntuliaka ziri ezi nke ala ha tinyere n'ụbọchị 4 nke ọnwa Jụlai. Akụkọ BBC Igbo na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Ipob ziri ndị otu ha Otu Ipob akpọkuola ndị otu ha nakwa ndị niile mkpamkpa ndị Boko Haram na ndị ọchịehi metụtara ka ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee. Ha kwuru na ọ bụ jị ruo ụjụ maka ndị ọchị echi kwafuru ọ bara ha nakwa ndị niile e gburu na mbọ nweronwe Biafra. Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful sị na ụbọchị ahụ ka ha ga-eru uju maka ndị nwụrụ n'aka ndị Boko Haram nakwa ndị na-achị ehi. Powerful sị na ""a ga-amụ anya mbọmchi n'abalị bọtara ụbọchị ahụ n'ụka, mọsk nakwa sinagọgụ bụ ebe a ga-ekpe ekpere maka mkpụrụ obi ndị nwụru n'aka nwakpo ndị Boko Haram nakwa ndị gọọmenti"". A gbanyele onyeisiala mba New Zealand ọlaaka nkwa alụmdi Enyi Jacinda Arden, Praim Mịnịsta mba New Zealand bụ Clarke Gayford agbanyela ọdịyanobi ọlaaka nkwa alụmdi. Akụkọ na mmadụ abụọ mere nke a pụtara ka otu onye ntaakụkọ anya ya dị nkọ hụrụ ka ọla mgbuke na mkpịsịaka nke etiti Arden were jụọ ụlọọrụ ya maka ya. Gayford na Arden zutere onwe ha mbụ n'afọ 2012 na mmemme inye nturuugo. Nwaada Ardern na Clarke Gayford chọrọ ịlụ Ọnụ na-ekwuru ya were kwuo na ha mere emume ikwerịtara onwe ha nkwa n'oge mmemme 'Easter.' Cheta na n'afọ gara aga, Arden mụrụ nwa mbụ ha. Arden bụ nwaanyị na-achị mba abụọ na-amụ nwa ka ọ nọ n'ọkwa ọchịchị. Onye mbụ mere nke a bụ Primae Mịnịsta chịị Pakistan Ugboro abụọ bụ Benazir Bhutto nwụrụ anwụ. Rochas Okorocha: Anyị ga-agbaso mkpebi ụlọikpe- Inec Inec ekwuola na ha ga-enwe ọgbakọ iji lebanye anya na mkpesa ọhụrụ nke Rochas Okorocha detara ha maka njichi ha jichiri asambodo mmeri ya. Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha kwusiri ike na akwụkwọ o degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu na nso nso a sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa Maachi ma kpọọ oku ka ha nye ya asambodo ahụ. Na nzaghachi, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na ndị isi ụlọọrụ ha ga-atụnye ọnụ n'okwu ahụ n'ọgbakọ ha ga-enwe n'izu ọzọ. ""Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu bụ onye Okorocha degara akwụkwọ anọghị n'ụlọ. Ọ gara alabekee. Ọ lọta, anyi ga-enwe nzụkọ banyere mkpesa ahụ Rochas wetara."" Mgbe BBC jụrụ ya na nzụkọ ahụ apụtara na a ga-ewepụta okwu ahụ n'ụlọikpe ebe ọ nọ ugbua, Okoye kwuru sị: "" A ga ahapụ okwu ụlọikpe ka ọ gaa ka o siri kwesị."" Ọ bụrụ na ụlọikpe si ka anyị nye ya akwụkwọ anyị enye ya. ""Ụlọikpe sị anyị enyela ya anyị agaghị enye ya."" ""Ọ bụ mkpebi ụlọikpe ka anyị ga -agbaso."" EFCC na ndị Yahoo n'Owerri EFCC anwuchiela mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị ha sị bụ ndị Yahoo Yahoo na Owerri. Nke a mere ka a gbachara ha ama maka ụdị okoko ndụ ndị ahụ na-ebi n'Okwu Urata, Aladinma nakwa Egbu nke dị n'Owerri, Imo steeti. Facebook Amachiela mmadụ atọ Milo Yannopoulous, Alex Jones na Louis Farrankhan Nwanna a, ị ma na Facebook nwere ike ịmachị gị ma ị zipu ozi nwere ike ịbute ọgbaaghara? Facebook machiri Milo Yiannopoulous, Alex Jones na Louis Farakhan bụ ndị ha sị na ha na-ezipu ajọọ ozi nwere ike ibute ọgbaaghara n'ụwa. Arsenal meriri Valencia 3- 1 Arsenal azaala odogwu n'asọmpị ha na ndị Valencia ụnyahụ bụ ebe ha ji ọkpụ atọ asatara otu nyụọ ha anya. Mmeri a mere ka Arsenal manye otu ụkwụ na agba nke ikpeazụ na egwuruegwu Europa League. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị taa" afirika-44186472,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44186472,Ị chọrọ ịma etu e si esi ojoko awayị? Lee ya ebe a,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmasị iri ojoko chara acha, mana ha amaghị na ojoko achaghị acha bụ ebe ejedebere ma ọ bụrụ ma e sie ya ọfụma.","Ojoko awayị bụ ezi nri na-adị nwata, okenye nakwa ndị na-arịa ọrịa tara nchara mma n'ahụ Ojoko 'abịrịka' maọbụ 'ogede' achaghị acha bụ ezi nri na-edozi ahụ. Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye n'ahụ siri kọwa, ojoko na-enye ọbara, potassuim, fibre na Vitamin dị icheiche. Ngwa eji ezi ojoko awayị 1. Ojoko achaghị acha (aka anọ) Ojoko achaghị nwere 'fibre' nke na-enyere nje na-egweri nri n'afọ aka ịrụ ọrụ ya nke ọma 2. Azụ ọkpọ (otu maọbụ abụọ) 3. Ụgụ 4. Mmanụ (ngazi ofe abụọ) 5. Ịsha (otu iko mmiriaraehi) 6. Ose (mkpụrụ ose iri) 7. Ogiri Igbo maọbụ ogiri bekee maọbụ ha abụọ (otu obere ngazi/ otu mpekere) 8. Yabasị (otu maọbụ abụọ) 9. Nnu Etu ị ga-esi sie ya O ghela! Weta efere na ngazi gị" afirika-50142431,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50142431,250 Account Probe: Gọọmentị Imo na-akpa agwa ụmụaka ọtaakara - Rochas Okorocha,Ndị ụlọomeiwu Imo steeti enyela ikike ka enyocha akara ọba ego narị abụọ na iri ise emepere mgbe Rochas Okorocha bụ Gọvanọ Imo steeti.,"Gọọmenti Imo steeti na enyocha Rochas Okorocha N'aka nke ọzọ, lekwa ihe Rochas Okorocha nwere ikwu maka nyocha Gọọmenti Imo steeti na-enyocha ya. Rochas Okorocha Onyeomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu kwuru na nyocha a bụ ka achịkọtaa ọba akụ ndị a ka ha bụrụ otu. Ihe nke a pụtara bụ na ha ga enyocha ọba ego ndia niile ka ha mara nke ego dị ma nke ego na adịghi. Ogbuagu kwuru na mgbe ha mechara ka ha ga-achịkọta ọba ego ndị a n'ihe ndị bekee na-akpọ 'Single Treasury account'. Ndị omeiwu a rịọrọ ka ndị Ụlọakụ nwe oba egoi ndị a nyere aka ka atụmatụ a gaa nke ọma. Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha Akụkọ Ga-Amasị Gị Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-54321605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54321605,Mgbe a ga-eweda ego ọkụ larịk - Odeakwụkwọ NLC,Emma Ugboaja bụ odeakwụkwọ Nigeria Labour Congress atụrisiela nkwekọrịta ha na gọọmenti etiti nwere gbasara nkwụsị ọrụ.,"Emma Ugboaja ekwuola mgbe gọọmentị ga-ebuda ọkụ latrik Ugboaja kwuru na NLC ebidobeghị gụwa ụbọchị ga-eru izu ụka abụọ maka mbụtụ ọnụ ego ọkụ latrịk gọọmenti weliri elu n'ihi na ha ahụbeghị akwụkwọ gosiri na ndị kwesiri ibutu ego a amatala maka mkpebi ahụ. Lee ka o si kọwaa ya n'ihe nkiri dị n'elu. Ndị ọrụ a nabatara nkagbu abụbụọrụ Sept. 28? Lee ihe ha gwara anyị Ụfọdụ ndị ọrụ ekwuola na ha nabatara etu Nigeria Labour Congress si kagbuo abụbụọrụ ha kwadoburu ime taa bụ ụbọchị Sepụtemba 28 maka mbuli ụgwọ ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala. Otu onye ọrụ na ministrị Tekịnụzụ nke Abia steeti bụ Chukwuma Igwe, kwuru na ọ gaghị adị mma ịfanye aka n'ụkwụ ebe a ka sicha nnọrọ n'ụlọ maka covid-19 wee pụta. O kwuru na nke a agaghị enyere akụnaụba obodo aka. Igwe kwuru na o kwenyere na gọọmenti etiti ga-emezu ihe ha kwere na nkwa n'izuụka abụọ ha nyere. Mana onyeisi otu NLC n'Enugu bụ Virginus Nwobodo, kwuru na ya nabatara mkpebi a kama na ọ bụrụ na gọọmenti etiti emezughi nkwa ha ma izuụka abụọ gafeecha, na ha ga-agbazị abụbụọrụ. O kwuru na ọ bụrụ na ha ekwughi maka abụbụọrụ a, na o nwereike ma ha enwetala n'ihe niile a gọọmenti kwuru na ha ga-eme. Nwobodo kwuru na o nweghị onye abụbụọrụ na-amasị makana ọ na-enye akụnaụba obodo nsogbu. Akwụkwọ ozi NLC wepụtara maka ihe ha chọrọ ka gọọmenti mere ha n'izu ụka abụọ a Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gọọmenti etiti na NLC kwekọrịtara kpatara nkagbu abụbụọrụ a Ihe ndị mere NLC ji kagbuo abụbụọrụ ha yiri maka Sept. 28 Gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ bụ Nigerian Labour Congress ekpebiela ka ha kwụsịtụ abụbụọrụ ha chọrọ ịgba ruo izuụka abụọ. Nke a na-abịa dịka gọọmentị kwụsịrị mbuli elu nke ọkụ latrik ma kwee nkwa inyere ndị ọrụ aka n'ụzọ dị iche iche. Mịnista ọrụ nke steeti bụ Festus Keyamo depụtara n'akara twiter ya na NLC na gọọmenti etiti nwere nkwekọrịta n'elekere abụọ na ụma nke ụzụ ụtụtụ taa bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ. Keyamo kwuru na ọnụ ego mmanụ ụgbọala ka dị n'aka ndị na-ere ya mana gọọmenti dịka gọọmenti wepụtara enyemaka maka ndị otu ruo izu ụka abụọ. O kwukwara na gọọmenti kwetara ibutu ụgwọ ọkụ latrịk ruo izu ụka abụọ mana ha hibere otu ga-elebanya na atụmaatụ mbụtụ ego a. Taa bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Septemba ka otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kpebibụrụ na ha ga-amalite abụbụọrụ ha maka mbuli ego ọkụ latrik nakwa nke mmanụ ụgbọala. Ụnyahụ bụ ụbọchị 27 ka ụfọdụ ndị otu NLC na gọọmenti nọ na-enwe mkparịtaụka ka a mara ma a ga-emere ha ihe kpatara ha ji aga abụbụọrụ. Mana ruo ugbua, otu NLC edepụtabeghị maọbụ kwuputa ma ya bụ nzụkọ amịtara ha mkpụrụ ka ọ mịtaghị. Cheta na otu jịkọtara ndị orụ na Naịjiria bụ NLC nyeburu gọọmenti etiti izu ụka abụọ ibutu ọnụego mmanụ ụgbọala maọbụ nke ọkụ latrịk. Lee akwụkwọ ahụ Keyamo wepụtara dịka nke gọọmenti na otu jịkọtara ndị ọrụ binyere aka. Nke mbụ Akwụkwọ ozi gọọmenti na NLC binyere aka Nke abụọ Nke atọ Anyị ka na-eche ịnụ n'ọnụ ndị isi otu jịkọtara ndị ọrụ kpọmkwem maka nkwụsị abụbụọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48865188,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48865188,Frank Lampard: Frank Lampard bụzị onye nkuzi Chelsea,"Chelsea akpọpụtara aha Frank Lampard, bụ onye nọrọ afọ 13 n'otu egwuregwu ha dịka onye nkuzi ha.","Lampard, dị afọ 41, nọbu achịkọta ndị Derby County tupu a kpọọ ya bịa Chelsea. Ọn ga-anọchịte Maurizio Sarri, bụ onye si Stamford Bridge n'ọnwa Juun gawa Juventus n'Itali. Lampard duru ndị Derby gaa mgbacha Iko ""Championship"" nke ndị Aston Villa nọchịrị ha ụzọ. Nke ahụ bụ n'ime afọ mbụ ya dịka onye nkuzi bọọlụ. Lampard win di Champions League with Chelsea in 2012 Onye a bu oney Ingland gbara Chelsea bọọlụ 648 ma soro ha tụọ ugo ugboro 11. Ọ sị, ""Obi dị m ụtọ nlaghachite m laghachiri Chelsea dịka onye nkuzi."" ""Mmadụ ncha ma etu m siri hụ Chelsea n'anya nakwa ejem m n'otu egwuregwu."" Lampard ga-abụ onye nkuzi 10 Chelsea Roman Abramovich ga-ewe n'ọrụ kemgbe o goro etu ahụ n'afọ 2003." afirika-43865416,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43865416,Nwaafọ Igbo Miracle Ikechukwu emeriela Big Brother Naija,"Miracle Ikechukwu meriri ihe nkiri Big Brother Naija nke atọ, mere ka o nweta nde naịra iri abụọ na ise (25m).","Miracle Ikechukwu nwetara vootu pasentị iri atọ na asatọ (38.18%) iji merie Big Brother Naija nke afọ atọ Miracle nke onye ọbụla na-akpọ 'fly boy' nwetakwara ụgbọala 'ọkwụ ọtọ ekele eze' nke ruru nde naịra iri na abụọ (12m) nakwa njem n'efu nke ọ ga-akpọnwu mmadụ gaa ruru nde naịra anọ na puku narị asaa (4.7m). O nwetakwara igwe eji akpọ egwu ruru nde naịra atọ (3m), nakwa nde naịra atọ na puku narị abụọ (3.2 million naira) bụ mgbakọ ego ndị o nwetara site n'ihe ndị onwetara n'asọmpi ndị o mere oge ọ nọ n'ime ụlọ ahụ. Nwaamadi a bụ onye na-efe ụgbọelu nke bekee kpọrọ pilot, kwuru na ọ chọrọ iji ego a nweta asambodo ga-eme ka o nwee ike ị na-efe ụgbọelu nke na-ebu ndị njem nke bụ Commercial Pilot License (CPL) na bekee. Ndị ọzọ ya na ha so rute n'ụbọchị ikpeazụ asọmpi ahụ; Cee-c nwetara pasentị iri abụọ na asatọ (28.04%), Tobi nwetara pasentị iri abụọ na abụọ (22.53%), Alex nwetara pasentị asaa (7.07%) ebe Nina nwetara pasentị anọ (4.18%). Lee ka o si ṅụrịa ọṅụ ka a kpọrọ aha ya dịka onye mmeri. Lee ebe o kelere ndị kwadoro ya ịhụ na o meriri." afirika-43269146,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43269146,Ndị ntọ atọrọla otu onye ntaakụko n'Ụmụahịa,Otu onye ode akụkọ bụ kwa onye nkwusa n'alagalaba mgbasa ozi akpọrọ Abacityblog.com bụ Ngozi Blessed Onwukwe ka akụkọ kwuru na ndị ntọ tọọrọ ya n'Ụmuahia.,"Anya hụrụ ka o siri mee kwuru na ọ bụ ụmụnwoke anọ bu ụgbọala Toyota Sienna tọọrọ ya n'ogologo ụzọ Ikot Ekpene dị n'Umuahia. O kwuru na nke a mere mgbe ọ na-achọ ị ga mmemme n'obodo Arọchukwu. O kwuru na Ngozi guzo n'akụkụ ụzọ ebe ọ na-eche ụgbọala, mgbe ụgbọala ahụ nọchiri ya ihu, ndị nwoke abụọ gbara dimkpa pụtara ma dọbaya ya n'ime ụgbọala ahụ. Akụkọ kwuru na o yi uwe edere ABACITYBLOG mgbe ha tọrọ ya. Mbọ niile agbara iji nweta ya n'ekwe ntị, mara afọ n'ala. Ndị tọrọ ya e mebeghi ka ndị ezinaụlọ ya na ọ bụ aka ha dịna ya. Ndị otu na-ahụ maka mgbasa ozi na ịntaneti ngalaga Abịa Steeti katọrọ ntọrọ Onwukwe. Ha kwuru ka ndị ọrụ nchekewa nke Steeti Abia gbalia gbapụta onye ntaakụkọ ahụ. Ụfọdụ ndị ntaaụkọ nọ n'Umuahia ndị BBC gbara ajụjụọnụ kwuru na ha anụbeghi ihe gbasara nke a. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji n'Umuahia bụ Janet Egwu Chukwu gwara ndị BBC na ekwenti na ọ maghị gbasara ihe nke a mere. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45094965,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45094965,Nwunye mmadụ ụkọchukwu tụwara ime anwụọla,"""Ọ bụ onye amụma ụgha?"", ""Chineke ekpugheela mmehie gị""...","Ihe ndị a bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụkọchụkwụ tụwara nwunye mmadụ ime. Ndị ọzọ na-ekwụkwa sị, ""Gịnị ka ọ na-akuziri ndị na-ekpe n'ụlọụka ya?"", ""I kwere ya nkwa ịgọzi ya, O kwe gị nkwa ịkwụghachị gị ụgwọ; ụgwọ ahụ bụ afọ ime, ite ime nakwa ọnwụ ugba."" Nwoke a ọ ga-azanwukwa okwu na ụka a o ji isi kote? Ngbeken Elvis dị afọ 32 na-ekpe ekpere niile dị n'ọnụ ya na-asị Chineke gbaghara ya maka mmiri ọkụ e ji egbu mbe ọ dabanyere n'ime ya ebe o soro nwunye mmadụ. A nwụchiri Ngbeken bụ ụkọchukwu na 'Christ Chosen Church of God,' ka enyi ya nwaanyị a ma dịka 'Mama Sarah' bụ nwunye mmadụ nakwa nne ụmụ anọ, nwụrụ ebe ọ gara ite ime ọ tụwara ya. Akụkọ kwuru na Ngbeken na Mama Sarah bụ onye di ya bi na mba ofesi, yịrị ọyị na nzuzo ọnwa isii. A ga-agbaghara ya? Dịka ụlọọrụ mgbasaozi The Nation si kwuo, Ngbeken kwuru sị "" A matara m nwaanyị a bụ Mama Sarah oge ọ na-arịa ọrịa. E kpeere m ya ekpere, o kwe m nkwa ịkwụghachị m ụgwọọrụ. ""Anyị bidoro ime enyi nwoke na nwaanyị, mana ụmụ ya amaghị. Oge otu nwa ya nwaanyị malitere ikpalite ntamu ka ndị agbataobi na-ajụ ihe kpatara m ji na-abịa n'ụlọ ha oge ọbụla, nne ya amajaa ya na ọ ga-achụpụ ya n'ụlọ."" Ọnwa atọ gara aga, ọ sị m kwabata n'ime ụlọ ha bụ ebe m bi ruo oge m nwetara ụlọ. Abụ m nwa enwe nne, e bughị m n'uche ibanye n'ụdị ọgbaghara a. Ọ gwaghị m na ọ dị ime. Amaghị m na ọ gara ite ime mana ihere emegbuola m. Ekpere m bụ ka Chineke gbaghara m. Echegharịala m. Ọ na-enyebu m N1000 maọbụ N2000 iji gaara ya ozi."" Di na nwunye mụrụ ejima atọ Ihe niile a Ngbeken na-ekwu abụghị ihe ezinaụlọ di Mama Sarah chọrọ ịnụ, ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nyeghachị ha ụgwọ isi nwaanyị ha kwụrụ. Ha ekwuola na Ngbeken ga-akwụ ụgwọ niile a ga-eji eli ya; nke a bụkwa ma ọ kwụchaa ụgwọ isi ya dịka nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị. Ngbeken na-ekwu na ndị ụlọụka ya kwụsịrị ya ọrụ n'ike maka oke nsogbu ọ na-enwe n'alụmdinanwunye ya; o kwuru na nwunye ya na-aluso ya ọgụ kamgbe ha gbara akwụkwọ n'afọ 2016. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 57187543,https://www.bbc.com/igbo/57187543,"Igbo Celebrities: Yul Edochie, Ụmụ Obiligbo... Lee ụmụ Igbo a ma ama na-eso nzọụkwụ nne maọbụ nna ha","Igbo na-atụ ilu sị na ""ihe agwọ mụrụ aghaghị ito ogologo"", maka na nne ewu na-ata ahịhịa, nwa ya a na-ele ya anya ọnụ.","Yul Edochie, Destiny Etiko, Umu Obiligbo Nke a pụtara na mkpụrụ nne na nna kụrụ ka ụmụ ha ga-ejide aka were na-eto. Ha dị ọtụtụ ụmụ Igbo a ma ama nke Bekee kpọrọ 'celebrities', ndị nne ha maobụ nna ha bụkwa ndị a ma ama n'oge nke ha. Ụfọdụ bụ ndị na-eme ejije onyoonyoo, ụfọdụ na-eti egwu, ebe ndị ozọ abụghị ihe nne na nna ha mere ka ha na-eme, mana ha bụkwa ndị a ma ama dịka nne na nna ha. Yul Edochie na Pete Edochie Pete Edochie na nwa ya bụ Yul Edochie A chọwa ụmụ Igbo ma ihe ha na-eme n'ejije Nollywood, aha Yul Edochie ga-abatarịrị ya. Nna ya bụ Pete Edochie bụkwa nnukwu mmadụ na Nollywood. 'Ọ bụ ""Feminism"" na-ebute ihe di ji eti nwaanyị ihe n'ụlọ' - Pete Edochie Yul kọwara na onweghị mgbe nna ya ji kpọrọ ya n'aka kpọbanye ya Nollywood, kama ọ chọpụtara na ọ bụ akaraka Chineke nyere ya o ji pụta ụwa. Mana iji gosi na ọ ga-eme karịa nna ya, Yul Edochie banyekwara ndọrọndọrọ ọchịchị. O so zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka gara aga, ma na-ekwukwa na ya ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023. Nna ya bụ Pete Edochie emeghị ihe ndọrọndọrọ ọchịchị chaachaa. Pete Edochie nwekwara nwa ọzọ aha ya bụ Linc Edochie, onye metụrụ ejije ntakịrị tupu o kwụsị. Mana akụkọ kwuru na ọ ka nọkwa na Nollywood, mana ọ naghị apụtakarịzi n'onyonyo. Destiny Etiko na Eucharia Etiko Destiny Etiko Ọbụghị ọtụtụ mmadụ ma na nne Destiny Etiko bụ Eucharia Etiko mere ihe ejije n'oge nke ya. Eucharia so na ndị a ma ama n'ime ihe ejije n'agbata 1990 dịrị gawa, dịka otu onye ma ya nke ọma si kwuo. O so n'ejije a kpọrọ ""Bless my Soul"", ""Royal Reward"", na ejije TV a kpọrọ 'Change and Smile' nke wuru ewu n'oge ahụ. Taa, nwa ya nwaanyị bụ Destiny Etiko so na ndị aha ha na-adụ ụda na Nollywood. Ejije Destiny Etiko sonyerela na ya karịrị ngụta ọnụ. Akunwafor Obiligbo na Ụmụ Obiligbo Akunwafor Obiligbo na Ụmụ Obiligbo Akunwafor Obiligbo bụ onye tiri egwu ekpili n'oge gboo. Ọ bụ ya mụrụ Akunwafor na Okpu ọzọ Obiligbo, ndị otiegwu e ji Ụmụ Obiligbo wee mara. Ụmụ Obiligbo malitere iti egwu ekpili, ụdị nke nna ha tiri, mana ugbua, ha na-etizi egwu ọgbara ọhụrụ. A marala Ụmụ Obiligbo ama gafee obodo Naịjirịa, karịa etu e si mara nna ha n'oge gboo. Clarion Chukwurah na Clarence Peters Clarence Chukwurah na nwa ya nwoke bụ Clarence Peters Clarence Peters bụ onye a ma ama na-emepụta onyonyo egwu (music videos). Nne ya bụ Clarence Chukwurah, onye a makwa ama n'ime ejije. Nna ya bụ Shina Peters, oti egwu aha ya na-ada ụda na Naịjirịa. Ray Emodi na Joy Emodi Ray Emodi na nne ya bú Joy Emodi Ray Emodi bụ aha a ma ama na Nollywood, nne ya bụ Joy Emodi bụkwa onye a ma ama. Mana ihe e ji mara Joy Emodi bụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụghị ejije Nollywood. Joy Emodi nọchiri anya Anambra North na ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa malite na 2005 ruo 2010. Uche Chukwumerije na Dike Chukwumerije Uche Chukwumerije (n'etiti) na ụmụ ya Chika (aka ekpe) na Dike (aka nri) Nna na nwa a bụcha ndị a ma ama, mana ihe e ji mara ha abụghị otu ụdị ihe. Uche Chukwumerije bụ onye omeiwu nọchitere anya Abia North malite na 2003 ruo 2015, ebe nwa ya bụ Dike bụ onye ode akwụkwọ nakwa ode abụ ama ama. Otu abụ wuru ewu nke si n'aka Dike Chukwumerije bụ nke oge o dere oge odogwu Chinua Achebe lara mmụọ, iji sị ya jee nke ọma. N'aka nke ọzọ, nna ya bụ Uche Chukwumerije, so ndị omeiwu gbara mgba ka onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo, ghara ịchị ọchị nke ugboro atọ, nke a kpọrọ 'third term agenda' n'afọ 2011. Uche Chukwumerije nwekwara nwa ọzọ a ma ama n'egwuregwu Taekwondo, aha ya bụ Chika Chukwumerije. O ritere ọla nchara n'asọmpi Olympics nke afọ 2008 e mere na Beijing, China. Kema Chikwe na Naetochukwu Chikwe (Naeto C) Naeto C na nne ya Kema Chikwe Naeto C bụ otiegwu a ma ama, ọ kachasị na mmalite afọ 2000 ga. Nne ya, Kema Chikwe, bụkwa onye a ma ama na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. Charles Soludo na Ozonna Soludo Chukwuma Soludo na nwa ya Ozonna Charles Soludo bubu onyeisi ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank', mana nwa ya, Ozonna, bụ onye a ma ama n'iti egwu. Ozonna bi na mba UK ebe ọ nọ eti egwu nke ya, mana aha ya anachaghị ewu ewu na Naịjirịa nke ukwuu. Kedụ ndị ọzọ ama ama ị ma nne na nna ha bụkwa ndị a ma ama?" afirika-46183760,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46183760,Sniper: Tupu i fee ya na nri gee ntị,"Ndị mmadụ na-atụ ụjọ ka a hụchara ihe nkiri gosiri ka a na-efe 'sniper' n'elu agwa, ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ihe nwere ike iweta nsogbu ahụike ma ọ bụrụ na a kpachaghị anya.","BBC jụrụ ọkachamara n'ihe gbasara nri bụ Taiwo Ubany, ma e nwere ihe dị njọ n'ife ọgwụ e ji egbu ahụhụ n'elu mkpụrụ nri. O kwuru na ọ dịchaghị njọ, mana ọ na-aka mma ka ọ bụrụ onye ma anya ya (ọkachasị onye a zụrụ n'ime ya) ga-efe ya na nri. O kwuru ""enwere ọgwụ eji egbu ahụhụ nke na-adị mma ife na mkpụrụ nri ma na gburugburu ụwa, ya mere na ndị na-eme ihe gbasara nri ma na enwere ndị nke nwereike imebi ahụ, mana ebe ha ma nke a, ha makwa oke ha ekwesịghị igafe. ""Ndị ọkachamara na nri agaghị agafe oke ahụ, abịa na ndị nke na-arụpụta nri, ndị ọrụ ha bụ ihụ na ha si n'usoro iwu arụpụta ya na-abịa elenyere ha anya ịhụ na ha agafeghị oke a. ""Ị kwuo maka kemịkal ndị a na-etinye na nri, enwere usoro e ji etinye ya iji echekwa mkpụrụ nri dịka edere ya n'ahụ karama kemịkal ahụ. ""Mana enwere usoro dịka ịkụ ya mmiri were gwagbuo ya tupu e fee ya na mkpụrụ nri, nke bụ na ụtọ na isi ya ekwesịla ịpụ mgbe ọ na-erutela n'ahịa. ""Ya mere o ji dị mma ka ọ bụrụ onye a kụzirila n'usoro e ji eme ya (onye ọkachamara). Ya mekwara e ji ekwu na ọ na-adị mma ịsa ihe nri si n'ahịa ugboro ugboro ruru atọ maọbụ anọ, tupu e sie ma rie ya. Ụfọdụ kemịkal na-aga na nri Ihe o nwereike ime n'ahụ Ubany kwuru na kemịkal ndịa nwere ike ibute ọrịa kansa n'ahụ ma e mechaa, makana kemịkal ndịa nwere ihe ndị dị iche iche o na-arụ n'ahụ. O nwekwara ike ime ka ihe Bekee kpọrọ ""immune system"" dị n'ahụ gị ghara isi ike, nwee ike chekwaa ahụ gị. Etu ị nwereike isi gbanarị kemịkal na nri Akụkọ ndị ga-amasị gị :" afirika-51509907,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51509907,Anger Management: Etu i ga-esi gbanahụ igbu mmadụ n'iwe,Otụtụ akụkọ maka ndị jị iwe gbuo mmadụ na-ewu na soshal Midia. Nke mere ka anyi na Dọkinta na-ahụ maka echiche na akparamaagwa tule ya bụ ihe.,"Anyị kpọtụrụ dọkinta Tolulope Oko-Igare onye bụ kwa onyeisi ụlọakwụkwọ na-ahụ maka ndụmọdụ akpọrọ 'Institute of Counseling' dị na Legos na Rivas steeti ka ọ kọwaara anyị etu mmadụ ga-esi gbochie ịjị iwe gbuo ọchụ ma ọ bụ mee ihe na-ezighi ezi. Kedu ihe mbụ ị kwesiri ime? O dị mkpa ka ị gaa nyọcha Tolulope Oko-Igare kwuru na ihe mbụ mmadụ niile kwesiri ime bụ ị ga mee nyocha ka ị mara ma ị nwere nsọgbụ akparamaagwa na-ebute iwe ọkụ nke bụ 'Personality Disorder' na Bekee. Oko-Idare na akọwa na ọtụtụ mgbe, ihe mmadụ gabigara na nwata ma ọ bụ ihe mmadụ mụtara na nwata na-eso eme ka mmadụ nwe nsọgbụ iwe ọkụ. O kwụkwara na ụkpụrụ omume mmadụ nke a na-akpọ 'Personality' na Bekee sokwa ebute iwe ọkụ. Ukpụrụ omume ndị a bụ 'Sanguine', 'Choleric', 'Melancholy' na 'Phlegmatic' n'olu Bekee. O kwuru na n'ime ụkpụrụ omume anọ ndị a, na ọ bụ ndị nke 'Choleric' na akacha enwe nsogbu iwe ọkụ. Ọ sị kwa na ihe kpatara nke a bụ maka na ""ha na-achọkarị ka ndị mmadụ mee etu ha siri chọọ"". Oko-Igare kwukwara sị "" Mmadụ kwesiri iwe iwe kama iwe ahụ bụruzịe mmegbu ma ọ bụ na-eme kwa mgbe, onye ahụ nwere ike i nwe nsọgbụ iwe oku"". Kedu ihe ị ga-eme ma iwe wee gị? Gụọ ọnụ ọgụgụ ma gwa onwe gị okwu Dịka Oko-Igare sị gwa BBC, mgbe ọ bụla iwe chọrọ iwe mmadụ, ọ dị mkpa ka onye ahụ jide onwe ya aka. Nke a nwere ike bụrụ n'ụzọ ị gụ ọnụ ọgụgụ nwayo nwayọ site na otu ruo iri ma ọ bụ iri abụọ. Ị kwesiri ime nke a tupu i kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe ọbụla. Nke a ga-eme ka iwe gị beleta. Sị ebe ahụ pụọ Ọ dị mma ka ị sị ebe ihe na-akpasu gị iwe pụọ Nke abụọ ọ kwara BBC bụ ka onye ahụ si ebe ahụ ihe na-agbasu ya iwe pụọ. Maka na ị nọro ebe ahụ, ihe ahụ gbasuru gị iwe ga na ebuli kwa iwe gi. Wetuo ume gị ala Oko-Igare kwukwara na o dị mma mgbe ọbụla iwe chọrọ iwe mmadụ, ka onye ahụ jiri nwayọ na-eku ume. Dịka ị na-eme nke a, ị na-agwakwa onwe gi okwu ka iwe gị beleta. Umeala so n'ihe na-ewetu iwe ọkụ. Ịwepụ uche gị- 'Aversion Techniques' Ụfọdụ na-eji RụbaBandị egbochi iwe ọkụ Ufọdụ ndị iwe ọkụ na-ewe karị nwere ike ịme ihe a na-akpọ 'Aversion Technique' n'olu Bekee. 'Aversion Technique' pụtara ịme ihe dị iche iche iwepụ obi gị na ihe ahụ na-akpasu gị iwe. E nwere ihe mgbanaka nke ọ na-abụ mgbe iwe gị lara elu o nwere ike tụọ gị mbo ịchetere gi ka ị wetuo obi ma wepụ kwa uche gị na ya bụ iwe. Oko-Idare kwuru na ị nwekwara ike iyi rụba bandị na-aka gị nke bụ na mgbe iwe ọkụ ahụ biara, ị were ya tụo onwe gị mbọ. Ihe kacha mkpa Mgbochị ọrịa ka ọgwụịgwọ ya. Nke mere na ihe kacha mkpa bụ ka onye ọbụla gaa mee nyọcha. Ihe ọzọ i nwere ike ịme bụ ị jụ ndị mmadụ ma ị na-akpa agwa ka onye nwere iwe ọkụ. Nke ọzọ bụ ka nne na nna hapụ ị kuziri ụmu ha iwe ọkụ dịka mgbe ha ji iwe agwa ha okwu ma ọ bụ tie ha ihe. Ọzọ bụkwa ndị nne na nna lebara ụmụ ha anya ma ha hụta iwe ọkụ n'agwa nwa ha, ka ha bido n'ọge chụwa ewu ojii tupu abalị erụo. Akụkọ ga-amasị gị" 45071283,https://www.bbc.com/igbo/45071283,Bilienu were oche na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa - Nwunye Osibanjo,Nwunye osote onyeisiala bụ Dolapo Osibanjo agwala ụmụnwaanyị Naịjirịa ka ha kwụsị ịranye akara aka ụmụ ha n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwesighi ntụkwasịobi.,"Nwaanyị Osibanjo gwara ụmụnwaanyị ka ha bilie ma were ọnọdụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. Osibanjo nọ na mbara ogige Alex Ekwueme n'Ọka dị n'Anambara steeti wee gwa ụmụnwaanyị n'ọgbakọ a kpọrọ Anambara Mothers 2018. O kwuru na ndọrọndọrọ bụ ebe a na-anọ eme mkpebi gbasara eti ihe si aga n'obodo nke ga-ekwu etu ndụ ndị mmadụ n'obodo ga-adị. Nwaanyị Osibanjo kwuru na ugbua abụghịzi oge ụmụnwoke na-eme mkpebi n'ihe niile gbasara ụmụnwaanyị. N'okwu ya; ""Ọ bụghị naanị ka unu banye ndọrọndọrọ mana nyenụ ndị niile nọ n'ime ugbua nkwado tọrọ atọ ma họrọnụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwere ntụkwasịobi ga-eme ihe ha kwuru."" N'akụkụ nke ya, nwunye aka na-achị Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano kwuru ka ụmụnwaanyị bilie sonye ma weta mgbanwe nke obodo Naịjirịa chọrọ ugbua. Ọtụtụ ekwuola na ụmụnwaanyị bụ ndị na-apụta akwara ụmụnwoke abịa oge ịchụ nta vootu mana ụmụnwaanyị anaghị apụta n'onwe ha ebe ụfọdụ ndị pụtakwara anaghị enweta nkwado n'aka ụmụnwaanyị ibe ha. Cheta na ụmụnwaanyị ndị omeiwu agwaala onyeisiala Mohammadu Buhari na ha chọrọ ka ụmụnwaanyị nwee otu ohere inweta oche dịka ụmụnwoke nwere n'ụlọomeiwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50683596,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50683596,Orji Kalu: Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche onye omeiwu ikpe mara,Okwu na-atụrụ aka chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu mkpọrọ afọ 12 maka nrụrụaka abụghị ihe a ka na-akọrọ onye ma ihe na-eme na Naịjirịa.,"Mana, okwu ihe ga-eme oche ya ka bụkwa ụkwa akpụ n'ọnụ. Maazị Kalu napụru Mao Ohuabunwa oche dịka onye na-anọchịta anya Abia Nọt n'Ụlọ Omeiwu Ukwu na ntụlịaka nke 2019. Maazị Ohuabunwa gbajọrọ mkpebi Inec were ga kpesara ụlọikpe ntulịaka. Ohuabunwa chọbụru ka akagbuo ntuliaka emere na Bende na Isikwuato mana n'ubọchị 11 nke ọnwa Nọvemba Ụlọikpe mkpesa kwadoro mmeri Kalu. Maka onye a mara ikpe, iwu Naịjirịa sị na onye ahu agaghị azọnwụ ọchịchi ruo afọ iri. Kedu ebe Kalu nọ n'iwu a? Orji Kalu nwetere ọkwa ""Chief Whip"" n'Ụlọ Omeiwu nke itoolu Ọkaiwu Chijioke Ikeh gwara BBC Igbo na okwu ihe ga-eme oche Orji Uzor Kalu na Ụlọ Omeiwu Ukwu kwụ ọtọ dịka ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na onye ọbụla a mara ikpe n'ụloikpe maka nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ agaghị azọ ọchịchị maọbụ kwụrụ ka ndị mmadụ tunyere ha vootu ruo afọ iri. N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ikeh sị na ugbua ikpe mara Maazị Kalu onwekwarụ ebe iwu Naijirịa dewere ya. Ọ sị; ""Ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na Kalu ka bụkwa omeiwu makana ikpe mara ya oge emechara ntụlịaka ma hopụtaya dịka omeiwu. ""Ihe iwu kwuru bụ na etu ọ nọ mkpọrọ, ọgaghị abịanwụ bịa nọchite anya ndị ọ na-anọchite anya ha ruo ihe gafere ọkara oge a na-ezukọ n'ime afọ, onyeisi Sineti nwere ike kwuo na mmadụ anaghị anọchite anya mpaghara ya."" Ọ gara n'ihu si na ihe a ga abụzị na-enwereike mee ntụliaka ọzọ ji nwete onye ọzo ga-anọchite anya mpaghara o si. Afọ ole ka Kalu nwereike ịno na mkpọrọ? Ka ọ kwụ ugbua, a na-ele anya na Kalu nwereike chọ mkpegharị dịka ọ ka nwere ohere ya, mana ya bụrụ na ọ chịtaghị aja na ya bu mkpegharị, onwereike nọdu ruo afo 12 na mkpọrọ. Nke a mee, ihe Ọkaiwu Ike kwuru nwereike mee, nke ga-apụta na a ga-azọgharị oche Abia Nọt a n'azụ Kalu. BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ Mao Ohuabunwa ịmata ma o nwere okwu maka atụmatu ahụ adabaghi." afirika-51346147,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51346147,Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị,Ndị ichie obodo Imerienwe kọwara ihe mere ha esoghi ụkpụrụ ndị nna nna ha n'omenala ịgba mbarị.,"Ha gwara BBC Igbo na mbarị bụ omenala ha zutere dịka a mụrụ ha, na onweghi onye dị ndụ ugbua nwereike ịkọwa mgbe ọ malitere. Dịka e si kọrọ ha, ndị na-agba mbarị na-anọkọ otu ebe were ọmụ na akịrịka gbachie onwe ha ruo ihe ruru afọ abụọ. Ndị a ga-amalite iji aja ụrọ na nzụ na-akpụ ụzụ dị iche iche n'ime afọ abụọ ha ga-anọ n'ime mbarị a. Mgbe ha kpụchara, ha ga-agba ya n'anwụ ka ndị ọha nwee ike hụrụ ihe ha kpụrụ Ha kwuru na ụfọdụ na-ahụta ya dịka agbara maka na ọ na-akụgbu onye mere ihe ọjọọ n'oge ahụ.. Ndi ichie kwuru na ọ bụ mgbe ụka Kraịst batara n'obodo, ka a kwụsịrị ịgba mbarị n'obodo ha ma were ya mere zie ebe nlereanya. Ndị mepụtara ihe nkiri a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu" afirika-44050400,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44050400,Ị mara ihe ọfọ bụ n'ala Igbo?,Ọfọ bụ osisi bara oke uru n'ala Igbo. Ọ bụ osisi jikọrọ Igbo ma mee ka Igbo guzosie ike.,"Ọfọ bụ osisi pụrụiche maka na ndị Igbo na-akwanyere ya ugwu nke ukwuu. Ndigbo nyere ọfọ ikike dị egwu dịka ikike e ji ekwu eziokwu, ikike e ji ahụ na anaghị emegbu mmadụ. Ọfọ bụ ihe a na-ahụ anya a na-eji na-egosipụta eziokwu maọbụ nkwekọrịta n'etiti ndị Igbo. E nwere osisi a na-kpọ osisi ọfọ mana ọbụghị osisi ọfọ niile ka-eji eme ọfọ. Osisi a na-eji eme ọfọ ga-eji aka ya daa n'ala mana ọbụghị ndị niile dara n'aka ha ka e jikwa eme ọfọ. Ọ bụ nke jiri aka ya dara onwe ya kpọwa ụzọ abụọ, otu isi ya che n'ọwụwa anyanwụ, otu isi eche isi n'ọdịda anyanwụ, oge ahụ, a mara na ọ bụ ọfọ daziri adazi. BBC Igbo gbara ndị mmaọdụ ajụjụọnụ ka ha kọwa ihe ọfọ bụ na ihe ọ pụtara n'ala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46851553,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46851553,Obosi: Nne ụmụaka atọ ọkụ gbagburu kpochiri ha n'ụlọ pụọ,"Njinji ọkụ ọgbụgba jiri n'Ugwuagba Obosi, Anambra Steeti ụbọchị ole n'ole gara aga bụ nke ka na agba ndị mmadụ anya mmiri.","Mgbe BBC biarutere na ya bụ ebe ọdachị mere, anyị chọpụtara na ya bụ nwaanyị ụmụ aka ya atọ nwụrụ bụ Oriakụ Blessing onye Nkerefi n'Enugwu steet mana dị ya bụ onye Ohaozara nke dị n'Ebonyi steeti. Otu enyi nwaanyị ahụ bụ Nurse Janet Kalu kọwara na afọ 2018 ka Blessing nwere nsogbu akwụghị ụgwọ ụlọ n'Ugwuagba ahụ, nke mere na onye ụlọ chụpụrụ ya na ụmụ ya atọ ahụ iro. N'ihi enweghị ego ọ ga eji kwụọ ụgwọ ụlọ ọzọ, ya bụ nwaanyị onye ya na di ya ebikọghị ọnụ duziri ụmụ ya ga biri na ụlọ igwe a na-akpọ container ebe ọ na akwa akwa. Onye welder nọ na-azụ shọp nwaanyị ahụ bụ Ifeanyi Nakwa nwaanyị na ere nrị na mmanya na akụkụ ya kwuru na otela ha bidoro dọwa Blessing aka n'ntị ka oghara ịdị na-akpọchịnye ụmụaka ya n'ime ụlọ igwe container were pụọ. Ha kọwara na ụbọchị ọkụ ahụ gbara, na Blessing kpọchinyere ụmụ ya atọ bụ Esther, Chiemerie na nke atọ n'ime ụlọ, sinye nrị n'ọkụ were gaba igota ihe n'ahịa mgbuka. Janet Kalu bụ ọyị nne ụmụaka ahụ bụ Blessing. Ifeanyi Kwara arịrị na oge okụ ahụ malitere, ha enweghị ike itika ya bụ igwe na nnukwu igodo ojiri gbachie ụlọ ganye na okụ agbagbuo ụmụ aka atọ ahụ. Otu onye na ndị na elekọta ogbe Ugwuagba Obosi ahụ Mazi Amechi Egwuonwu kọwara ka ya siri gota out tanker mmiri were na aagbanwụ ya bụ ọkụ mana tupu akụkaa ụzọ nwaanyị ahụ gbachiri, ụmụ ya atọ erela ka unyi. Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu Ọtụtụ ka nọ na anya mmiri yọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị idi na akpọchinye ụmụ ha n'ụlọ ma ọ bụ n'ime ụgbọala ka ha were gbanahụ ụdị mberede a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55572062,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55572062,Joe Biden enwetela ikike n'aka ndi omeiwu ịbụ onyeisiala site 2021 ruo 2024,Nke mere ugbua bụ na Osote Onyeisiala Amerịka bụ Mike Pence kpọpụtara mpụtara ntuliaka emere na mba ahu a 2020 ma kwuo na ndị Omeiwu ha anabatala mpụtara ha nke mere Joe Biden Onyeisiala ma mee Kamala Harris Osote ya.,"Nke na-abịa dịka ndị Omeiwu si pati Repọblịkan gbara mbọ ịkagbu mmeri Biden na ụfọdụ steeti. Ka nke a mere, Ọbi Onyeisiala Amerịka wepụtara ozi na Onyeisiala Amerịka bu Donald Trump ekwenyela ""enyefe ọchịchị n'udo"" n'oge Biden ga-aṅụ iyi ọrụ na Jenụwarị 20. Mana, n'okwu a Trump gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ ya meriri ntuliaka e mere n'afọ 2020. Na chi bọrọ ụbọchị 7 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Trump zigara ndi na-akwado ya ka ha gaa wakpo ụlọ Omeiwu eji Capitol mara dịka ndị omeiwu na-arụrịtaụka banyere mpụtara ntuliaka 2020 ahụ. Ndị Amerịka hụrụ ihe ha ahụbeghị mbụ dịka mwakpo ahu na-aga n'ihu. Pence emeghị ihe Trump rịọrọ ya Dịka Onyeisi Ụlọ Omeiwu Ukwu, ọ bụ Mike Pence gupụtara mkpebi ndị omeiwu wepụtara. Ihe a o mere ka ọ bụrụ na ọ gbajọrọ arịrịọ Trump rịọrọ ya ka ọ kagbuo mmeri Biden. Ndi ọzọ ekweghi ime ieh Trump chọrọ bụ Onyeisi Pati kachasị na Ụlọ Omeiwu Ukwu bụ Mitch McConnell. Ndị na-arụ ọrụ na White House agbaala arụkwaghịm Iwe ihe a mere na Capitol mere ka ụfọdụ ndị na arụ ọrụ na Whiet House rituo n'ọkwa ha. E nwekere mkparịtaụka atumatụ iji iwu a kpọrọ ""25th Amendment"" chụọ Trump n'ọrụ. Iwu a bu maka usoro eji achụtu onyeisiala anaghi arụ ọrụ ọfụma n'ọrụ. Ọ bụ Ilhan Omar na-ahazie atụmatụ ịchụ Trump n'ọrụ." 55333085,https://www.bbc.com/igbo/55333085,BVN with NIN: Federal gọọmentị ga-eji akara NIN dochie nke BVN - Isa Pantami,Gọọmenti Naịjiria ekwuola na ha amalitebeghị usoro iji National Identity Number (NIN) nọchịe Bank Verification Number (BVN).,"Nke a bụ ihe Uwa Suleiman bụ ọnụ kwụchitere 'Ministry of Communication and Digital Economy' gwara BBC dịka o na-ekwu okwu gbasara akụkọ na gọọmenti ewerela NIN nọchie BVN. Akụkọ pụtaburu na minista na-ahụ maka teknụzụ na Naịjirịa bụ Isa Pantami kwuru mgbe ọ na-eduharị ndị ntaakụkọ iji gosi ha etu ịdebanya aha na NIN sị aga, na gọọmenti etiti nwere ebumnuche ịji NIN nọchie BVN. Mana Uwa kwuru na ọ bụghị ihe mịnista kwuru ka ihe ahụ pụtara. O kwuru na minista na-ekwu maka etu inweta NIN si dị ezigbo mkpa nakwa ezi nchekwa ọ nwere ruru pasenti 99.9. Pantami kọwara na BVN bụ atụmatụ ebe NIN bụ iwu. Gụọ ihe ndị Naijirịa na-ekwu maka nke a Gọọmentị Naịjirịa agbatịala oge ha nyere maka idebanye aha na NIN nakwa ijikọ ya na akara ekwentị site ugbua ruo izuụka asatọ na-abịa abịa. Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mgbasaozi n'ekwentị nakwa ụlọọrụ n'ahụ maka akara njirimara mmadụ. Onye tinyere aka n'akwụkwọ a bụ minista mgbasaozi n'igwe ekwentị bụ Isa Pantami. Cheta na a sịburu na idebanye aha ga-akwụsị n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Fenụwarị, 2021. Oge ijikọ NIN na akara ekwentị ga-ebi n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021 Onye na-ahụ maka ihe gbasara iwu obodo nke ndụ ụloọrụ National Identity Management Commission bụ Hadiza Dagabana gwara BBC Igbo na gọọmenti etiti Naịjirịa nyere maka ijikọ National Identity Number nakwa akara ekwenti ga-ebi n'ụọchị itolu nke ọnwa Febuwarị afọ 2021. Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ruo ugbua ha enwetebeghị ya bụ NIN ma ya fọrọ ijikọ ya na ekwenti ha. NIN Registration: Ihe mere ndịọrụ NIMC ji gbaa abụbụọrụ Cheta na ikwesiri ịjịkọ NIN gị na akara SIM Airtel,Glo na MTN iji eme intaneti. Cheta na ndị ndịọrụ na-arụ na ngalaba ""National Identity Management Commission' (NIMC) gbara abụbụọrụ nso nso a maka enweghị ngwaọrụ zuru oke ịrụ ọrụ ha. Ndị mmadụ ka na-ege nti ka ha mara ma o nwere ihe ga-agbanwe tupu echi e nyere dịka ngwụcha eruo. Etu ị ga-esi si n'ekwentị gị nweta akara 'National Identification Number' gị I nwere ike ịmata akara njirimara onye Bekee kpọrọ ""National Identification Number"" (NIN) site na iji akara 'USSD, n'ekwentị. Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka akara njirimara onye, a kpọrọ ""National Identity Management Commission"" (NIMC), sị ụmụ Naijiria ha pịa *346# n'ekwentị ha iji mata akara 'NIN'. Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ NIMC nyere ndị Naijiria naanị izuụka abụọ iji were denye akara NIN ha n'akawụkwọ ndenye aha SIM ha meburula mbụ. Onye ọbụla nọ na netwọk MTN, Airtel, 9mobile maọbụ Glo, nwere akara USSD nke ya.. Ọ bụ ngalaba na-ahazi nkwụrịtaụka n'ekwentị bụ NCC n'ịchafụ wepụtara amụma ọhụrụ nke mere ya iwu na onye ọbụla nwere ekwentị ga-etinyerịrị akara njirimara ya n'akwụkwọ ndebanye aha ndị nwere ekwentị. Ọ bụrụ na i nwere ekwentị mana idebanyebeghị aha gị mbụ maka kaad njirimara NIN lee usoro ị ga-agbaso iji mee nke a: Nzọụkwụ Mbụ Nzọụkwụ nke Abụọ Nzọụkwụ nke Atọ Ịnata akara 'NIN' gị Kedụ etu ị ga-esi ama na Kaadị NIMC ọ dịla? Gaa na websaịtị National Identity Management Commission [NIMC] website- www.nimc.gov.ng Gaaa na mpaghara websaitị ahụ ebe e dere 'e-ID Card Status Portal' , pịa ya iji maata na ọ dịla nakwa ebe ị ga-aga were ya. Tinye aha gị, aha nna gị nakwa akara NIMC nyere gị maka ịchọ ya ma pịa 'check now'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44328328,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44328328,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena Williams awakela ọzọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzọ,"Serena gbara dị afọ 36 nọzi na agba nke atọ na French opun Agbara nwaanyị na egwuruegwu tennis bụ Serena Williams sị ụwa chere aka ghọrọ ya na ọdịnihụ. Serena bụ onye meriri Ashleigh Barty nke mba Australia sị na ya ga-emecha sịe ike karịa ka ya dị bụ tupu ya amụọ nwa bụ nke sechituru ya nwaazụ na-egwu. Rochas anọghị n'ọgbakọ APC Owelle Rochas bụ Gọvanọ Imo Steeti Achọrọ Owelle Rochas achọ na ọgbakọ ndị APC n'Abụja ụnyahụ ebe ọtụtụ ndị isi ọzọ ndị pati ahụ zuru na ya bụ ọgbakọ Owelle sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya bụ onyeisi pati ahụ na ọwụwa anyanwụ a nọghị ya. Cheta na Rochas na ndị pati ya malitere ịnwe ọgbaghara nsonso a. Boko Haram agbuola ndịagha ise na Boronu Ndị agha ka na-ebuso Boko Haram agha n'ala Naịjiria Na Boronu steeti unyahụ, ndị Boko Haram wakporo ma ta isi ndị agha Naịjirịa ise. Texas Chukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuputara nke a mgbe ọ sị na ndị omekaome a basara ndị agha operation Lafia dole ọgụ mgbe ihe a mere. Nkatọ esochiela mbuli ụtụisi ngwa ahịa igwe Trump Onyeisiala Donld Trump Nkatọ esochiele ụtụisi nke onyeisiala Trump nke Amerịka tinyere na-azụm ahịa igwe ndị mba ọzọ. Trump weliri ụtụisi ngwa ahịa na-aka mba EU, Canada na Mexico bụ ndị fooro ntutu ta na ha ga abọrọ mbọ. Gee nkeji ụtụtụ tata: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu" media-45713321,https://www.bbc.com/igbo/media-45713321,PDP Primaries: Ihedioha ga-azọrọ ndị PDP ọchịchị n'Imo,Emeka ihedioha abụrụla onye ga-anọchị anya otu pati PDP n'izọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti.,"Ntuliaka imeụlọ PDP n' Imo Onye so ya n'azụ n'ọnụọgụgụ vootu a tụrụ bụ Samuel Anyanwu nakwa Ethan Achonu. Ndị mmadụ pụtara n'igwe maka ntuliaka ime ụlọ PDP n'Imo steeti. A na-azọ ọnụụzọ na ama egwuregwu Kanu Nwankwo ebe ntuliaka imeụlọ PDP Imo steeti na aga ugbua. Ebe niile na-ede jimjim dịka onye ọbụla chọrọ ịhụ isi ya na ntuliaka. Ọ na-akpọtụ akpọtụ, na-azụ azụ Ọnọdụ maka ntuliaka ahụ na-ekwo ka ahịa. Lee ya n'ihe nkiri a: Ntuliaka imeụlọ PDP n'Imo steeti Oke ndọrọndọrọ so ntuliaka ahụ Dịka otu onye PDP na-anọchite anya okpuru ọchịchị Nwangele siri kọwaa, usoro a gbasoro ime ilele aha(accreditation) na ntuliaka ahụ mere ka ihe sie ike karịa ka o kwesịrị. Ntuliaka PDP na Okpuruọchịchị Nwangele Imo steeti Akụkọ kachasị:" afirika-43688139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43688139,Nzeribe: Igbo kwesiri ịnweta steeti abụọ ọzọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Chuma Nzeribe kwuru maka mmegbu ndị Igbo,"Chuma Nzeribe nọchiteanya Ihiala Federalụ Konstituensi n' ụlọomeiwu nke nta ugboro abụọ Onye bụbu onye nnọchịte anya Ihiala Federal Constituency na ụlọomeiwu nta bụ Chuma Nzeribe ekwụola na Steeti abụọ ndị ọzọ jiri karịa nke ndi mpaghara ọwụwaanyawu na Naịjịrịa bụ ụzọ aghụghọ e ji akpagbụ Ndigbo. Na mkparitaụka ya na Vanguard, Nzeribe sị na o so na mmegbụ ndị kpatara akwa nnwereonwe a na-ebe n'ala Igbo. Gov. Ganduje ekwetaghị na ụmụaka binyere aka Gọvanọ Ganduje gọrọ na ụmụaka soghị binye aka na ndọrọdọrọ ọchịchị emere na Kano Gọvanọ Abdullahi Ganduje nke Kano steeti agọla na ebụbọ a na-ebo na ụmụaka erụbeghị afọ iri an asatọ mere ntụliaka nke okpụrụ ọchịchị emere na steeti ahụ. Ganduje sịrị na onweghị ihe gọsiri na foto ahụ gosiri na ụmụaka so mee ntụliaka bụ na Kano ka ọ mere. Cheta na INEC ka na-enyonye anya na ya bụ ebụbo. Lula de Silva nọ na mkpọrọ afọ iri na anụọ ụgbụa Onye chiburu Brazil bụ Lula Silva chọkwara ịlahachị azụ na ọchịchị tupu ụkwụ akpọ ya Onyeisiala ndị Brazil chiburu mbụ ga amalite nga afọ iri na abụọ ụlọikpe tụrụ ya na onwa a. Amara Lula da Silva ikpe maka mpu na angari oriri mgbe ọ nọ na-ọchichi. Man U bụ ọdachị nye ndị Man City n'egwuruegwu nke Premia lig Ndị otu egwu bọlụ Manchester United siri na azu napụ ndị Manchester City mmeri nke kara ị meha okaibe na Premier league. Man U ji Ọkpụ 3 asatara 2 napụ ndị Man City ike. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Kanu Nwakwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m" afirika-48479082,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48479082,Okorocha's monuments: Onye zitere ndị bịara ịkụda ‘Akachi'?,Gọvanọ ọhụrụ Imo bụ Emeka Ihediora si na aka ya adịghị ya. Rochas Okorocha na-ebokwa ebubo na ọ bụ Ihedio zigara ndị mere ya.,"Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu kemgbe e mechara ntuliaka 2019 Kedụ onye zitere ndị kuru akụkụ ụfọdụ akpụụ akụ 'Akachi' n'Imo? Ndị a na amatabeghi ndị ha bụ buru igwe e ji akutu ụlọ were bia ikutu akpụrụakpụ Akachi. Akpụrụakpụ Akachi Cheta na ọ bu onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha kpụrụ akpuruakpu a ebe osote onyeisiala Naịjirịa bụ Okammuta Yemi Osibanjo kpuhere na izu ụka abụọ gaara aga. Ndị onye ntaakụkọ BBC gbara ajuju ọnụ kwuru na ọ bụ n'ehihie Monde ka ndị mmadu bịara kwụsi ndị bịara ịkụda akụrụakpụ Akachi. Ọgu bịara ida nke mere ka ndịagha ji ụgbọala na-agbafe bịara kwusi were chusaa ndị mmadụ. Onye odibo pụrụ iche na mgbasaozi nke Gọvanọ Emeka Ihedioha bụ Steve Osuji gwara BBC na Gọọmenti ha amaghi ihe gbasara ikutu akpụrụakpụ Akachi. Mazi Osuji kọwara na ha ka batara ọchịchị ọhụrụ,na ọ bụghị Gọọmentị nyere iwu ka a kwatuo akpụrụakpụ Akachi. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: 'Gọọmenti zigara ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ ka anyị nwetara ozi ihe na-eme' Ka ọ si dị, onweghi onye ma ọ bụ ndị kwetere na ọ bụ ha biara ikwatu akpụrụakpụ Akachi. Kama ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ onye kpọpuru Govmenti ụlọikpe maka na ya na Govementi na-adọ ala ahụ kụturu Akachi. BBC ga- ewetere gi akụkọ a n'uju ya. Akụkọ ga-amasị gị:" 48692965,https://www.bbc.com/igbo/48692965,Xenophobic Attacks: Ndị Nigeria 5 merụrụ ahụ na nsogbu dara n'etiti ụmụ Naijiria na ndị Togo,Nsogbu bidoro n'etiti enyi na enyi aghọọla ọgbaghara mba na ibe ya gara ata isi mmadụ ma ọ buru na ndị uweojii egboghị ọgụ ahụ n'oge.,"Ndigbo etiri gwo gwo maka okwu agbasaghị ha na mba Togo bụ ndị agbataobi onye nwere okwu Nsogbu dapụtara n'etiti Ndigbo bi na mba Togo na ndị ha bi be ha edugala mmadu ise n'ụlọọgwụ ebe ha na-anata nleta maka oke mmerụahụ ha nwetara. Ebe ọtụtụ ka na-agụkọ ihe furu ha dịka ndị a na-arụ aka na ha bụ ndị Togo wakporo, zuo ma mebicha ngwaahịa ụfọdụ ụmụ Igbo na-azụ ahịa n'Ahịa Assiyeye dị na Lome, isiobodo Togo. ""Obi adịghị m mma ma e jiri egbe m rụpụtara gbuo mmadụ""- onye ọkpụụzụ Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ esemokwu dị n'etiti okorobia Igbo na enyi ya nwaanyị bụ ihe bidoro nsogbu ahụ. Mmadu abụo ahụ bụ ndị bikọrọ ọnụ nwere nghọtahie lụọ ọgụ merụọ onwe ha ahụ, nke nwaanyị gara kpọọ ndị agboro mana nwokorobia ahụ gbara ọsọ oge ọ hụrụ ha. Akụkọ kwuru na dịka ọ gbara ọsọ ha bido ịwakpo ndị Igbo ndị ọsọ bi na mbara ahụ, kụtọsịa ha dịka ha boro ha ohi. BBC Igbo nwetara ihe onyonyo gosiri ebe a kụrụ ndị ahụ ihe tinka na-akụ panụ, ọbara juu ha ahụ mana anyị agaghị enwe itinye ya n'ime akụkọ n'ihi na ọ bụ ihe na-ata arụ n'anya nke ukwuu. Dika otu onye Igbo achọghị ka a kpọ aha ya siri kọwara BBC Igbo, ""Ọ bụ nwoke ya na enyi ya nwaanyị bi nwere nghọtahie."" ""Ha kụọ onwe ha ihe. Nke nwoke merụọ nke nwaanyị ahụ, nke nwaanyị merụkwa nke nwoke ahụ."" ""Nke nwaanyị gbapụọ kpọrọ ụmụ agboro bịa."" ""Oge nwoke hụrụ ndị agboro, ọ wụọ aja gbaalaga. Ndị agboro gaa tiwa ọnụụzọ ụlọ Ndigbo bi n'otu mbara ahụ kụwa ha ihe."" Ọ gara n'ihu boo n'ebubo na ndị mba ahụ nyere nkwado dịka a na-akụ ndị ahụ ihe n'ihi ""ha ejighị ntị anụ ihe banyere Ndigbo."" Ahịa Assiyeye dị na Lome,Togo Otu onye ahịa ya so na nke ndị e zuru a kpọrọ Godwin Kalu gwara BBC Igbo na ọ bụ ka ndị uweojii bịara zọọ ụmụ Igbo ahụ ka ndị igwe ndị ala chọrọ isunye ha ọkụ. Kalu kwuru na ka ndị uweojii kọrọ ndị e merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ, ddị ala ahụ jịkọọ gawa ahịa Assiyeye ndị nso ebe ahụ ebe ha wakporo ọdọahịa Ndigbo ma zuo ma mebie ọtụtụ ngwaahịa ha. ""Ọdọahịa nọ n'ọnụ okporoụzọ esi abanye n'ime ahịa"". ""Ha wakporo ọhịa na-elu okwute. M na ndị nọ n'ọdọahịa gbagbuo n'ime kpochie ụzọ."" ""Ha buru akpa akpụkpọụkwụ m na-ere ere abụọ. ""Otu akpa nwere akpụkpọ ukwu iri ise."" Ndigbo nọ na Togo tụrụ arịrị na mbeku ha bekuru ụlọnnochiteanya Naijiria na mba ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka a gwara ha n'onyeisi bụ Segun Ibidapo-Obe gara njem na Naijiria. Otu onye uweojii mba Togo achọghị ka a kpọọ aha ya (n'ihi na o nweghị ikike ikwu n'aha ndị uweojii) gwara BBC Igbo n'ekwenti na ihe ahụ mere n'ezie. ""Anọ m a kpọ m gwa m na o nwere ndị a na-eti ihe, anyị ga-ebe ahụ ọ bụrụ ndị Naijiria."" Onye uweojii onye kwuru na ndị na-akụ ihe boro ha ebubo izu ohi, kọwara na ha (ndị uweojii zọpụtara ndị ahụ ma dugaa ha ụlọogwụ.) O kwụghị ma ndị uweojii a na-enyocha ya bụ okwu na ọ gwara Ndigbo bi n'ala ahụ atụla ụjọ ihe egwu ime ha ọzọ. Mbọ BBC gbara ịnụta uche ụlọnnochiteanya Nigeria na mba Togo amịtaghị mkpụrụ dịka ha azaghị ekwenti ha na ozi e zigara ha site n'igbeozi ịntanet. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44135412,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135412,Gọọmenti etiti ọ na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe?,Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara iwu Naijiria na ikike dịrị onye akatọla gọọmenti etiti dịka o si gbasa ebubo na ha na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe ka ọ sị masị ha.,"SERAP : ""Oke nnupụ isi na mkpebi ụlọikpe megidere nkwụsị ike nke iwu ala anyị na nkwuruonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe Na nkọwa ha, ha kwuru na nke a ga-ebute nsogbu nye ikpenkwụmọtọ na ọchịchị onyekwueucheya. Kemgbe onyeisiala Muhammadụ Buhari ji banye n'ọchịchị n'afọ 2015, e nwela ọtụtụ mkpebi gbasara ndị nwere agba n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, nke gọọmenti nupuru isii na ya. Ha gụnyere: Mkpebi ụlọikpe ndị gọọmentị etiti gbahapụrụ 1. Mkpebi ka a tọhapụ Ibrahim El Zakzaky, onye a kpọchiri kemgbe Disemba 14, 2015 2. Mkpebi ka a tọhapụ onye bụbu onye ndụmọdụ gọọmenti n'ihe gbasara nchekwa bụ Sambo Dasuki 3. Mkpebi ụlọikpe nyere maka Nnamdị Kalu, onye ndu otu Ipob 4. Mkpebi maka Olisa Metu, onyebụbu odeeakwụkwọ mgbasaozi PDP 5. Mkpebi e nyere ka ahapụ Dino Melaye 6. Mkpebi ikwupụta ego ole ha nwetara n'ego e zupụrụ na nke e nyere SERAP Ọkammụta n'ihe gbasara iwu bụ Chidi Odinkalu sị, ""Ilebaa anya ị ga-ahụ ọtụtụ ikpe ekperela gọọmenti achọghị ime."" Odinkalu onye bụbụ onyeisioche (National Human Rights Commission) NHRC kwuru na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị mebicha nhazi iwu ala anyị(rule of law), na oge nyekwa nsogbu oge maa pụtara n'ọchịchi inweta ikpemkwụmọtọ. O na-tee aka tupu ụfọdụ mmadụ e nweta ikpe zuru oke na Naịjirịa N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Collins Okeke kwuru na nnupụsị gọọmenti na ige ntị na mkpebi ụlọikpe ga-eme ka ""ọgbaghara dị n'obodo"". ""Ndị mmadụ ga-ebido sobe ihe gọọmenti na-eme kwusị ige ụlọikpe, onye ọbụla a na-emezi ihe sọrọ ya."" Okeke kwuru na gọọmenti kwesiri ịna atọ ezi mkpụrụ site na ime ihe ụlọikpe kwuru ka ọchịchị onye kwuo uche ya were tọọ atọ n'ala Naijiria. Ọ bụghị sọ ndị ọkaiwu na-akatọ agwa a gọọmentị etiti na-akpa. Gọọmentị etiti gbahapụrụ mkpebi ka a tọhapụ onye bụbu onye ndụmọdụ gọọmenti n'ihe gbasara nchekwa bụ Sambo Dasuki Abali ole na ole gara aga, otu na-agba mbọ maka ikike dịrị mmadụ nke a kpọrọ Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) na bekee kpere gọọmenti Naijiria n'aka United Nations. SERAP na-ebo gọọmentị ebubo na ha na-ege ntị na naanị mkpebi ụlọikpe masịrị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. Otu a kwuru na oke nnupụ isi na mkpebi ụlọikpe na-emegidere nkwụsị ike nke iwu ala anyị na nkwuruonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe(judiciary.) Gee ihe Odinkalụ kwuru n'uju: Ihe Prof Chidi Odinkalu kwuru Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55012534,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55012534,Bobby Brown: Etu ọnwụ sị napụ ya ụmụ ya na nwunye ya,Ọnwụ bụ nsogbu ụwa o nweghi onye ga-agbanwenwu mana ọ bịarala oti egwu Bobby Brown ugboro atọ n'ụzọ ọjọọ.,"N'ụbọchị Wenzde, akụkọ malitere ịfegharị na Bobby Brown jnr bụ diọkpara Bobby Brown nwụrụ na be ya n'obodo Los Angeles. Ndị uweojii na-enyocha ya bụ ọnwụ kwukwara na ha echeghi na o nwere onye aka ya dị n'ọnwa nwa Bobby Brown jnr. Ebe o si kara njọ bụ ụdịrị ọnwụ erughieru abịarala ezinaụlọ Bobby Brown ọrịrị mbụ site n'ọnwụ onye bụbu nwunye ya bụ Whitney Houston nakwa nwa ha bụ Bobbi Kristina. Whitney Houston Bobby Brown lụburu odogwu n'iti egwu bụ Whitney Houston n'afọ 1992. tupu ha agbasaa n'afọ 2007 ha mụtaRA nwa nwaanyị akpọrọ Bobbi Kristina Brown. N'afọ 2012 o wuru ewu n'ụwa niile mgbe achọtara Whitney Houston ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya. Nchọpụta nke e mere gbasara ọnwụ ya gosiri na ọgwụike dị ya n'ime ọbara mgbe nwụrụ. Dịka ụlọ ntaakụkọ si kwuo, News.com Australia Brown kwuru na ọnwụ Whitney wutere ya nke ukwu n'ihi na ọ ọ na-agba mbọ ịkwụsịi ọgwụ ike ma tụgharịa ndụ ya. Bobbi Kristina Boobi Krstina bụ naanị nwa Whitney na Bobby Brown mụrụ n'afọ 1993. Achọtara ya etu e si chọta nne ebe mmiri gbagburu ya n'ime be ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ. Mpụtara nchọpụta emere gosiri na ọgwụike na mmanya ike dịi n'ime ọbara ya. E buru ya gawa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nso n'ọnwụ rue ọnwa ole na ole tupu agbanyụọ igwe na-ekuru ya ume, o were nwụọ n'afọ 2015. Bobby Jr Achọtara diọkpara Bobby Brown na be ya dị na Los Angeles na mba Amerịka n'ọnwa Novemba afọ 2020. Ọ dị afọ iri abụọ na asatọ mgbe ọ nwụrụ. Amabeghi ma ọgwụike maọbụ mmanya ike eso na ihe gburu ya mana nyocha na-aga n'ihu dịka ndị uwoejii mba ahụ si kwuo. Bobby Brown na ezinaụlọ ya ndị ọzọ Brown na Kim Ward mụtakwara ụmụ atọ gụnyere diọkpara ya nwụrụ anwụ nakwa La'Princia. Ọ lụkwara onye na-elekọta egwu ya anya bụ Alicia Etheredge n'afọ 2012, ha amụọ ụmụ atọ. Nwa ya nwaanyị bụ La'Princia na diọkpara ya bụ Bobby Brown jnr na-emekọ ọfụma dịka nwanne na nwanne." 42985391,https://www.bbc.com/igbo/42985391,Ụlọomeiwu nta: Chụọ Ibrahim Idris n'ọrụ,Ha sị na Idris enweghị ike ibelata ogbugbu ndị mmadụ na mpụ ndị ọzọ na-ari elu na Naịjirịa ugbua.,"Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria Ha kwukwara ka onyeisi ala tinye onye uwe ojii ọzọ ga-arụ ọrụ dịka o kwesịrị. Mkpebi a ndị omeiwu mere sotere oku Nuhu Damburam bụ onye otu APC na-anọchite Kano, kpọrọ maka mkpa ọ dị ilebanya na mkpamkpa ndị agboro ndọrọndọrọ na-akpazi na Kano steeti. O boro ebubo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa anaghị eme ihe ọbụla doro anya maka ọgbaghara jupụtara na'Naijiria ya. Cheta na izu ole na ole gara aga, Sineeti kpọrọ Ibrahim Idris oku ka ọ bia kọwara ha ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ." afirika-50038687,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038687,"Boko Haram Insurgence: Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti",Gọọmentị Borno steeti na-achọ iwe ndị na-achụ nta n'ọrụ iji buso ndị Boko Haram agha na steeti ahụ.,"Gọvanọ Babagana Zulum chọrọ dinta puku iri (10,000) n'atụmatụ ọ sị ga-enye aka ibibi ndị Boko Haram. Zulum kwuru na o nwetala ihe ruru mmadụ puku abụọ si na mpaghara Ugwu Naịjirịa, bụ ndị dinta ga-enyere ndị agha aka ịluso ndị Boko Haram ọgụ. Isa Gusau bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Zulum, gwara BBC Newsday sị ""Dinta ndị a si na mpaghara dị iche iche n'ugwu. Ihe gbasara oke ọhịa dị iche iche doro ha anya nke ọma. ""Gọvanọ Zulum na-eche na ọ ga-aka mma itikọta atụmatụ dị iche iche iji alụ agha a. Ndị dinta a ga-enyere aka n'igosi ụzọ"". Cheta na agha Boko Haram a malitere kemgbe afọ 2009 ataala isi ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ. Amnesty International ebola ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ebubo mmegbu ọzọ Ndị ngalaba ikike diiri onwe dịka ha na-ebido ""Freedom of Expression Brief"" Ngalaba na-ahụ maka ikike dịirị onye bụ Amnesty International, ekwuola na mwakpo na ịcha ọkụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-acha ndị ntaakụkọ ejirila otu ụkwụ karịa ibe ya. Ha kwuru sị na ọ kacha njọ ebe ndị na-anaghị atụ ụjọ ịkatọ gọọmentị nọ, nke mere na a nwụchiela ihe ruru ndị ntaakụkọ iri na itoolu kemgbe mbido afọ a. Mana ndị ọrụ nchekwa agọrọla ụkwụ na aka ha kwa mgbe gbasara nke a. Gụọ maka ya n'uju ebe a: Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a Sịnịgal emeriela WAFU Youssouph Badji nyeere Sịnịgal goolu n'egwuregwu ikpeazụ ha ji bulie iko a Sịnịgal meriri Gana iji maburu iko asọmpi Wafu bụ asọmpi ndị mba si mpaghara west afrịka, nke afọ 2019. Otu abụọ a gbaburu onye laba onye laba ka ha abụọ nyere otu goolu n'ime nkeji 90 tupu ọ banye na penariti nke 'gbaa ka anyị laa'. Naịjirịa bịakwara asọmpi a, mana obodo Cape Verde mere ha Aaron gba aka ka ha ji penariti gbapụ ha n'agba anọ nke ikpeazụ. '#NoPantDay' na-ewu Gịnị bụ nke a? N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba 2019, e mere ""#NoBraDay"" iji kwuputa maka ọrịa akpụ nke ara. Mana ugbua, ndị mmadụ na-ekwuzi ka ụmụnwaanyị ghara iyi drọs n'ụbọchị 14. Lee ụfọdụ ihe ha kwuru: __mrjoe jụrụ kedụ ọrịa akpụ nke kpatara a ga-eji ghara iyi ọbante? Malaysia amaala ụmụ Naịjirịa 119 ikpe ọnwụ - Amnesty International Ụmụ Naịjirịa dị mmadụ otu narị na iri na itoolu (119) ka a marala ikpe ọnwụ na mba Malaysia maka ibu ọgwụ ike. Nke a bụ dịka otu 'Amnesty International' si depụta n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Mọnde. AI bụ otu a ma ama n'ụwa ọrụ ha bụ iwulite ikike dịịrị onye. Ha kwuru na mmadụ dị otu puku, narị abụọ na iri asatọ na otu (1,281) bụ ndị a mara ikpe ọnwụ na Malaysia n'ọnwa Febrụwarị 2019. N'ime ndị a, narị ise na iri isii na asatọ abụghị ndị Malaysia. Ọgwụ ike Enugwu AI kwuru na ihe dị otu a adịghị mma. Otu ahụ chọrọ ka a kwụsị ịma mmadụ ikpe ọnwụ na Malaysia nakwa na mba niile nke ụwa. Abụbụ ọrụ ndị NLC Otu jikọtara ndị ọrụ bekee bụ Nigerian Labour Congress agwala ndị otu ya ka ha jikere ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị iri na isii ọnwa Ọktoba. Ha sị nke a ga-eme maọbụrụ na gọọmetị emeghi ihe ha chọrọ banyere ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ. Mkparịta ụka mbụ ha na gọọmentị nwere mara afọ n'ala nke mere e ji yigharịa ọzọ na Tuzde 15 Ọktoba, 2019. Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ. Ebe a ga-etinye pesentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa. Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ. A hụla ụmụaka itoolu a tọrọ na Kano n'Ọnicha Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Ndị uweojii Kano Steeti ekwuola na ha azọpụtala ụmụaka itoolu a tọọrọ na Steeti ahụ dịka akpọ ha gaa Ọnịcha dị n'Anambra Steeti. Kọmishọna uweojii na Steeti ahụ bụ Ahmed Iliyasu gwara ndị ntaakụkọ na ha kpachiri mmadụ asatọ a na-enyo na aka ha dị n'ịtọrọ ụmuaka ndị a. N'ofesi Ihe karịrị mmadụ puku narị etinyela aka n'ịchọ nakwa ịzọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ihi oke ifufe na mmiri ozuzo metụtara na Japan na Satọde. Oke mmiri ozuzo a a kpọrọ Typhoon Hagibis bụ nke kacha ọjọọ na metụta Japan n'ime ọtụtụ afọ. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ndị Bulgaria bụ Krasimir Balakov ebola mba Ingland ebuboi ịkpaoke agbụrụ ebe ọ dị ukwuu. Nke a na-abịa dịka Bulgaria ga-ele Ingland ọbịa taa n'asọmpi itozuoke nke Euro 2020. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12" afirika-46792007,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46792007,MC Oluomo: Ọgbaghara dapụtara n'achụmnta vootu APC na Legọs,Akụkọ dị mkpa: A gbaala ndị ntaakụkọ abụọ egbe na Legọs,"Mgbọ tụrụ otu n'ime ndị ntaakụkọ si n'ụlọọrụ 'New Telegraph' bụ Tope Ogunbanke nakwa Emmanuel Oladesu si n'ụlọọrụ 'The Nation'. Nke a mere dịka ọgbaghara dapụtara n'ọgbakọ achumta vootu ndị APC mere maka ọkwa gọvanọ nke Babajide Sanwo-Olu na-azọ. Otu onye ntaakụkọ ya na Ogunbanke na-arụ ọrụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na mgbọegbe tụrụ ogbo ya n'agba. N'aka nke ọzọ, mgbo tụfrụ Oladesu n'isi, ha abụọ natara nleta. A sụrụ Musiliu Akinsanya a ma dịka MC Oluomo mma na ọgbaghara suru n'etiti ndị agboro dị iche na ndị na-eso MC Oluomo ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụkwara ahụ. Onye bụ MC Oluomo? MC Oluomo bụ onyeisi ndị agboro n'Oshodi, Legos. Ndị otu NLC chọrọ ka gọọmenti etiti kwụwa ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruru puku naịra iri atọ Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii nọ na Legos na-achọ otu onyeisi ndị agboro a kpọrọ Mustapha Adekunle onye a na-etu 'Seigo.' Ha na-ebo Seigo ebubo ibute ọgbaghara ahụ nakwa ikposaa ọgbakọ achụmta vootu APC mere. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti kwuru na ọ bụ Seigo na ndị otu ya bulitere ọgbaghara ebe ""a nọrọ maa MC Oluomo mma, e buga ya Eko Hospital ebe ọ na-enweta nleta."" Oti kwukwara na ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ maka ihe mere. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ya Wunderkid kwuru na ihe a mere ga-eme ka ọ ghara ịpụta n'ụbọchị ntụlịaka. Ebe Okeybams kwuru maka ụjọ ji ya n'ịlaghachi be ya N'Enugwu taa Ndị njem ụgbọelu tọrọ n'ọdọụgbọelu Enugwu n'ụbọchị tuusde dịka ụgbọelụ Arik efepụghị n'ihi ihu eluigwe adịghị mma. Airpeace gburu oge otu awa tupu ha efepụ n'ụtụtụ a. Ebe Ethiopian Airline gbukwara oge ma ha na-abanye ụgbọelu dịka ozi a na-apụta. Ndịagha Ụgbọelu Akwamozu ndịagha ụgbọelu Naijiria nwụrụ n'ọdachi ụgbọelu E mela akwamozu ndịagha ụgbọelu Naijiria ise nwụrụ n'ọdachi ụgbọelu ụbọchị Tuzde n'a National Hospital dị n'Abuja. Perowei Jacob,Kaltho Paul Kilyofas, Auwal Ibrahim, Adamu Nura, Meshack Ishmael, nwụrụ n'agha ndị agha megide Boko Haram na Borno n'abali abụọ nke ọnwa Januwari. N'ofesi, Mba Amerịka amachiela mba venezuala ka ọ fọrọ abali abụọ ka onyeisiala Nicolas Madura banye n'ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ. Odeakwụkwọ maka agbaego mba Amerịka kwuru na ọtụtụ ndị nọ ndị ọchịchị nso na-ekpori ndụ, ebe ndị ala ha na-ata ahụhụ. N'egwuregwu, A họpụtala Egypt dịka mba ebe a ga-ehiwe asọmpi iko Afrika bụ AFCON nke afọ 2019. Cheta na ahọpụtaburu mba Kamerun mana ha adịghị njikere eji napụ ha ikikere ị hazi ya bụ asọmpị. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Abụbọ-ọrụ ndị ASUU ọ ga-akwụsị? Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ụmụakwụkwọ mahadum etiela ebewu dịka otu jikọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU ekwuola na ha ga-enyocha nkwa ọhụrụ gọọmentị kwere ha tupu ha akwụsị abụbọ ọrụ. N'aka nke ọzọ, otu jịkọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC na-akwado ime ngagharịiwe n'ihi oge gọọmentị na-egbu n'izigara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ụgwọ opekatampe ọhụrụ. N'akụkọ ọzọ, Ndị otu NLC chọrọ ka gọọmenti etiti kwụwa ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruru puku naịra iri atọ Otu jikọtara ndị isi ntaakụkọ bụ ""Nigerian Guild of Editors"" akpọọla oku ka ndịagha Naịjirịa tọhapụ ndị ntaakụkọ abụọ ha nwuchiri na mwakpo ụlọọrụ mgbasa ozi Daily Trust. Onyeisi ndị otu a bụ Funke Egbemode kwuru na mwakpo a ndị agha mere bụ ihe agba ochie na-ekwesighi ime n'oge ọgbara ọhụrụ a. Na mba ofesi, Egbuola ndị agha mmadụ abụọ n'ime mmadụ ise chọrọ ịnaara ọchịchị n'ike na mba Gabon n'ụbọchị Monde. Ụlọọrụ onyeisiala ha bụ Ali Bongo kwuru na a nwụchiela mmadụ atọ ndị ọzọ ebe udo ewerela ọnọdụ na mba ahụ. N'egwuregwu, Taa ka aga ama ndị ga-abụ ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka nke ụmụnwoke n'etiti Mohammed Salah, Sadio Mane na Pierre-Emerick Aubameyang. Ebe ndị nke nwaanyị bụ n'etiti Fransisca Ordega, Asisat Oshoala na Chrestina Thembi Kgtlana. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50970141,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970141,Amaka Igwe: Ihe iri ị na-amaghị maka nwaada Igbo a larala mmuọ,"Taa ka Amaka Igwe gaara agba afọ iri ise na asaa, mana ọnwụ ekweghi.","Ulọọrụ 'google' tinyere onyonyo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha n'ụbọchị Tozde Amaka bụ nwaada Igbo ji eme ọnụ, onye e ji ime ihe nkiri wee mara. Vicky Nwogu Ọ bụ otu onye n'ime ndị mere ka mmepụta ihe ejije na Naịjirịa kwụrụ chịm dịka ọ dị taa. Ụlọọrụ 'Google' tinyere onyonyoo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde iji kwanyere ya ugwu. Lee ihe ndị pụtara ihe maka ndụ ya bụ agbara nwaanyị: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Lee emume mgba ndị Imerienwe" afirika-51994110,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51994110,Coronavirus: Onyeisiala Buhari ekwuola okwu n'onyonyo banyere coronavirus,N'ikpeazụ onyeisiala Buhari emeela ihe ọtụtụ ndị Naịjirịa na-atụ anya n'aka ya nke bụ ka o kwuo okwu n'onyonyo maka coronavirus.,"O mere nke a site n'ihe onyonye onye enyemaka mgbasaozi bụ Bashir Ahmed wepụtara na twitter. End of Twitter post, 1 Buhari sị na ya ministri ahụike na-arụkọ iji hụ na e chekwara ndị Naịjirịa site na ọria Covid-19 dịka ọ bụ nke kachasị ọchịchị ya mkpa ugbua. Ọ gwara ministri a ka ha gbaa mbọ dosa ihe ọrụahụike ọbụla dị mkpa iji buso ọrịa agha. Legọs enyeela ndị ọrụ bekee ezumike izuụka abụọ Gọomenti Legọs Steeti enyeela ndị ọrụ bekee nọ n'ogogo 1 ruo 12 ezumike izuụka abụọ dịka ụzọ iji kee nkwụcha na mgbochi ọrịa coronavirus. Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nyere iwu a na mgbasaozi o mere n'ụbọchị Sọnde. Ọ sị na ụzọ mgbochi niile etinyere iji gbochie ọrị a ka dị ire ma kwuo na onye ọbụla si ofesi bata nọrọ n'ime ụlọ ruo izuụka abụọ. 'Coronavirus ga-agabiga Abia maka na Abia dị n'akwụkwọ nsọ' Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Gọvanọ na-achị Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekwuola na ọrịa coronavirus agaghị erute Abia nso n'ihi na ọ bụ steeti e dere aha ya n'akwụkwọ nsọ. O kwuru nke n'ihe onyonyo mgbe ya na odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Onyebuchi Ememanka na-akparịtaụka. Ikpeazu bụ onye kpere nke a dịka ekpere sị na dịka Abia bụ steeti e dere n'akwụkwọ nsọ na Chineke kwere nkwa na ọrịa ọjọọ ọbụla agaghị erute ndị Abia nso. Ọ sị na oge ọrịa ebola, monkey pox na ụmụnne ya bịara, na ha eruteghi n'ime Abia steei, na ọ bụ otu aka ahụ ka coronavirus ga-eji gafee na-eruteghi Abia. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpọrọ Abia n'ọnụ na soshal midia. Onye bụ Ifeanyi George nwụrụ anwụ? Ifeanyi George si Enyimba banye Rangers International FC na 2016 Otu onye egwu bọọlụ Rangers International nke Enugwu ji eme onụ bụ Ifeanyi George alaala mụọ n'ụtụtụ Sọnde. Ifeanyi nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ ka o si Enugwu aga Legọs. Dịka akụkọ siri kwuo, ọ bụ ya na mmadụ abụọ ọzọ nọ n'ime ụgbọala oge mberede a mere. Otu egwuregwu bọọlụ Rangers kwuru n'ihe a mere n'akara Twitter ha. Ọtụtụ ndị ihe ya na amasị na-ezigara ezi na ụlọ ya ozi itiaka n'obi na soshal midia. Foto ndi mmadu setere n'ebe mberede mere gosiri na ụgbọala ya banyere n'okpuru ụgbọala. Akụku na-ekwu na nwaamadị a nọ n'ụzọ ịlaghachị ebe o bi na Legọs dị ka akagburu asọmpị premiership na Naịjirịa oge ihe a mere. Ifeanyi George na-agbaburu Enyimba nke Aba bọọlụ. Coronavirus na Gana N'Afrika, otu onye anwụọla na mba Ghana n'aka Coronavirus dịka mba ahụ gbachiri ọpụpụ na mbata ụbọchị Satọde. Otu onye ọkachamara na ngalaba World Health Organisation ekwuola na inwete ọgwọ mgbochi nje a ga-rucha otu afọ. Mike Ryan bu onye na-ahu maka gbata gbata ahuike na WHO sị a na-agbalị mana ọrụ ka dị n'ịmata ma ọgwụ enwere o ga-enye nsogbu ma aṅụọ ha. N'egwuregwu Lorenzo Sanz weere oche na Real madrid dịka onyeisi site n'afọ 1995 ruo 2000 N'egwuregwu, onye bụbụ onyeisi oche ndị Real Madrid, Lorenzo Sanz anwụọla n'aka Coronavirus ụbọchị Satọde. Sanz gbara afọ iri asaa na isi tupu ọnwụọ bụ ya kpọbatara Roberto Carlos, Clarence Seedorf na Davor Suker mgbe ọ nọ n'ọchịchị. Ọgbakọ ndị gọvanọ agbatarala ndị ọkụ meturu ọsọ enyemaka Ọgbakọ ndị Gọvanọ na Naịjrịa akpọrọ Nigeria Governors Forum enyela nde narị naịra abụọ maka inyere ndị ọkụ gbara ihe ha n'Abule Ado aka, Legọs steeti. Abdulrazaque Bello-Barkindo bụ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha kwuputara nke a ụbọchị Satụde. Legọs steeti hibere akpaego ha kpọrọ Abule Ado/Soba Emergency Relief Fund maka ịnyere ndị ya bụ ọkụ metutere aka. Ndị nọchite anya ọgbakọ ahụ nke Gọvanọ Kayode Fayemi nọ n'isi ya gara njem nleta na-ebe ya bụ ihe mere. Ka Fayemi kwuchara maka ego a, ọ gwakwara ndị mmadụ na ego ọzọ nwekwara ike isi an akpa ndị steeti dị iche iche bịa. Fayemi bụ onye ihe mere ebe ahụ gbagwojuru anya tiri ndị mmadụ aka n'obi. Coronavirus n'Ogun steeti Achọpụtakwala na otu onye ọzọ ebutela Coronavirus na Ogun steeti. Nigeria Centre for Desease control bụ ndị kwuru nke a n'akara Twitter ha n'ụtụtụ taa Nke na-ebute ndị ahụrụ nje a n'ahu ha mmadụ iri abụọ na isii nke mmadụ abụọ n'ime ha agbakela ma laa be ha. Achịọla ndị otu nzuzo na Mahadum Abuja Ubọchị Faịde ka Mahadum Abuja chụrụ ụmụakwụkwọ iri abụọ na anọ maka isonye otu nzụzọ. Aka kpaara ụmụaka ahụ ka ha nọ n'ime ọhịa eme emume ịsonye otu ahụ díka ndị obodo gbara ha ama. Obi adighị ndị nga mma N'ofesi, Ọgbaghara adaala na mkpọrọ iri na anọ na mba Colombia dịka ndị eji ebe ahụ na-agbarụ ịrụ maka na-atọhapụghị ha ka ha ga zere isi onwe maka coronavirus. A na-eche na ọ nwere ka ndị nga a niile ahụ sị nwe nkwekọrịta ịmalite ya bụ ọgbaghara. N'egwuregwu Robert Lewandowski na Anna, nwunye ya Robert Levandowski nke Bayern Munich na onye be ya enyela otu nde Euro maka ibuso coronavirus agha. Leon Kọreska na Joshua Kimmik nyekwara otu nde Euro maka otu agha ahụ. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46607137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46607137,NASS: Ihe mere ndị uweojii jiri kpọchie ihu ụlọomeiwu Abuja,"Ndị uweojii gbochiri ụlọomeiwu, jụ na ndị ọrụ na ndị ntaakụkọ agaghị abata ebe ahụ ụbọchị Tuzde, Disemba 18, 2018.","Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọomeiwu n'Abuja ka ọ na-eme bụ Yusuf Tijani, kwuru na ndị uweojii kọwara na nke a bụ iji chekwa ndị na-abata n'ọgbọ ụlọomeiwu. Ndị uweojii kwuru na e nyere ha iwu ichekwa akụkọ kwuru na Cheta na ndị ọrụ ụlọomeiwu bidoro abụbọọrụ ụnyaahụ bụ Monde, dịka ha na-eti mkpu ka a kwụọ ha pasentị 28 na mbugo ụgwọ ọnwa e ji ha kemgbe afọ 2010. Dịka ha nọ na-eme abụbọọrụ, ụfọdụ ha bịara ọrụ iji nyopụta ma ndị ogbo ha abịara. Mana dịka ndị ọrụ ụlọomeiwu na-eme ngagharịiwe maka ụgwọ e ji ha, ndị ụlọomeiwu ukwu na ndị nta nwere ọgbakọ ha. Mana dịka Tijani siri kwuo, ọtụtụ n'ime ndị omeiwu abịaghị ọgbakọ ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44773154,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44773154,Ihe otu CUPP na-eme iji 'chutu' Buhari,Ihe ruru otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị 40 kpokọtara onwe ha ọnụ ịhụ etu ha ga-esi merie Onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka 2019.,"Nke a so na nnukwu ihe merela n'ime ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, ka mba a na-akwado ime ntuliaka onyeisala nakwa ọkwa ọchịchị ndị ọzọ n'ọnwa Febrụwarị 2019. Otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), otu R-APC nakwa ọtụtụ pati ndị ọzọ binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke Bekee kpọrọ 'Memorandum of Understanding' n'Abuja taa, iji bịakọta ọnụ. Otu ọhụrụ a kpọrọ onwe ha 'Coalition of United Political Parties' (CUPP) Ha kwuru na ihe ha chọrọ bụ imeri Onyeisiala Buhari ma gbapụta Naijirịa n'ihe ha kpọrọ ""ọchịchịrị"". Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị Sinetọ nọ n'ọkwa ugbua, ndị ụlọomeiwu nta nakwa ụfọdụ gọvanọ steeti kwụnyere n'azọ ọgbakọ a. Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme na Naịjirịa, cheta na ụdịrị mbịakọta ọnụ a bụ ihe so nye aka ichutu Goodluck Jonathan n'ọkwa onyeisiala n'afọ 2015. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43242223,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43242223,Bọjetị: Enugwu steeti ekewapụtala ijeri naira 103 maka 2018,"Gọọmenti Enugwu steeti akọwaputala ka ha ga-esi were ego gbakọtara N103,563,500,000 wee ruo ọrụ n'afọ a bụ 2018.","Kọmishọna na-ahu maka okwu ego na nkwalite akụ na ụba na Enugwu steeti, Eucharia Uche Offor, mgbe ọ na-akọwa Bọgetị ụnyaahụ n' Enugwu Onye Kọmishọna na-ahụ maka okwu ego na nkwalite akụ na ụba nke Enugwu steeti bụ Eucharia Uche Offor kọwara na ya bụ ọkpụrụkpụ ego ọrụ bụ nke e nwere olileanya na ọ ga akwalite akụ na ụba Enugwu steeti na ebe o di ukwuu. Ego ọrụ afọ 2017 ji obere ihe were karia nke 2018. Gọọmeti kọwara na nke a ga-enyere gọọmenti aka iji usoro mkpachapụanya were kewasia ego ọrụ nke afọ a. Enugwu steeti na- ele anya ị nweta ego karịrị ijeri naira iri ise na otu site n'aka gọọmenti etiti, ebe ha na-elekwa anya na ego a ga-enweta na steeti nke a kpọrọ 'internally generated revenue' ga-eru ijeri naira abụọ kwa ọnwa. Ọ gbariri ya bụ nkọwa ọzọkwa kwa wee sị na mịnịstrị dị icheiche ga-eketa ego ọrụ a ma were ya rụọ ọrụ dịka gọọmenti steeti Enugwu siri kwado. Ihe dika ndi ọrụ aka nọọrọ onwe ha nke a na-akpọ SMEs n'aha ịchafụ bụ nke gọọmenti ga-enyere aka ka ha wee gbaa mgbọrọgwu. Ndị Kọmishọna dị icheiche nọ n'ọgbakọ ahụ zara ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ gbara ha banyere ka ha ga-esi were ego e nyere mịnịstrị ha rụọ ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye Kọmishọna na-ahụ maka mmiri bụ Ọkaikpe COC Egungbe kwuru na kemgbe Governor Ifeanyi Ugwuanyi batara na ọchịchị, na ụlọ ọrụ ya na-agba mbọ ka mmiri na-agba ebe ọbụla n'ime Enugwu steeti. Egumgbe gwara ndị Enugwu ka ha nwe ndidi maka na oge na-adịghị anya mmiri ga na-agbazi ebe ọ naghị agba na mbụ. Kọmishọna na-ahu maka azụmahia na mmepụta ihe bụ Ogbu Nwobodo kwuru na Enugwu bụ steeti kacha dị mma mmadụ iguzobe ụlọ nrụpụtaihe nakwa azụmahia na Naijiria. Ndị ọzọ zakwara ajụjụ ma kọwaa maka mịnịstrị nke ha. Ihe Kọmishọna Uche Offor kwuru: Kọmishọna Uche Offor gwupụtara na ha nwere olileanya na gọọmenti Enugwu steeti ga-eji Bọgetị afọ 2018 were nweta uru ndị a: •Ndị ọrụ oyibo mara ọrụ ha. •Nakwa ime Enugwu ka ọ bụrụ ebe ndị jiegoachụego na-agbata, ndị azụmahia kwụrụ onwe ha na-abia ma nwetakwa ọmụrụnwa na usoro eji azụ ahịa dị mma." afirika-46375822,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46375822,Anambra Assembly Crisis: Ọ ka na-akpọtụkwa n'ụlọomeiwu Anambara,Ndị omeiwu Anambara ka na-ama aka maka ndọrọndọrọ onye ga-anọ n'isi oche dịka onyeisi ha.,"Onye bụ onyeisi ụlọomeiwu Anambara? Ndị na-akwata ya bụ Rita Maduagwu, bụ onye a chuturu n'ọkwa dịka onyeisi ndị omeiwu Anambara, na Ikem Uzoezie, bụ onye ụfọdu ndị omeiwu kwadoro ka ọ nọchie anya Maduagwu. Cheta na ndị na-akwado Uzoezie kwuru na ha chuturu Maduagwu n'ime izuụka atọ gara aga, mana okwu ahụ nọ zị n'ụlọikpe. E chere na ọgu nwereike ịda n'etiti otu abụọ n'ụlọomeiwu Anambara Steeti nke mere ndị uweojii ji gbachie ụloomeiwu. Mana taa, ndị uweojii mepere ya, nke nyere ohere ka otu abụọ a banye ụlọomeiwu. Ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu Anambara bụ Kingsley Uruba gwara BBC na nsogbu dapụtara mgbe Maduagwu gwara Uzoezie ka o bilie n'oche onyeisi ulọomeiwu. Uruba sị; ""Maduagwu achọghị ikweta na ya abụzighi onyeisi. Ọ chọghị ikwete na a chutuola ya, ọ bu nke a bụ isiokwu."" BBC kpọrọ Maduagwu ịnụta olu ya n'okwu banyere nke a, mana ọ sị na ya nọ n'ime nzukọ. Amabeghị ebe okwu a na-aga, mana ka ọ dị ugbua, okwu ka dị n'ogwu n'ụlọomeiwu nke Anambara. Akụkọ pụtara mbụ na soshal midia bụ na nzukọ ndị omeiwu gara n'udo dịka Umeh Jospeh Chinedu dere n'akara Facebook ya: Onye ọzọ aha ya bụ Okoye Francis tinyere ihe nkiri gosiri ihe mere mgbe ndị omeiwu a zutere na Facebook: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45105595,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45105595,Ndụ Ekweremadu dị n'aka Ndume - Ndị ụlọomeiwu Igbo,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n' abalị a :,"Onye na-arụ dịka onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo nyere iwu ọkụ ka onyeisi DSS bụ Lawal Musa Daura ritua ozigbo ma nyefee ikike n'aka osote ya End of Twitter post, 1 Osote onyeisiala na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osinbajo ejirila iwe chụtuo onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Lawal Musa Daura. Cheta na ndị ọrụ nchekwa DSS wuchiri n'ụlọ ndị omeiwu taa ma gbochie ha ịba n'ime ọgba ụlọomeiwu. Ndị ụlọomeiwu ntaa si na mpaghara ọwụwaanyanwụ ekwuola na ha ga-ejide Sinetọ Ali Ndume ma ọ bụrụ ọkọ ọbụla kọọ Ike Ekweremadu n'aka ndị EFCC. Onye ndu ha bụ Chukwuma Onyema kwuru na Ali Ndume na-afụnye ndị EFCC ọkụ maka inyocha Ekweremadu. Mba Ofesi: Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka ekwuola na mba Amerịka na mba ọbụla ha na ndị Iran na-azụkọ ahịa agaghị enwe mmekọ. Nke a bụ maka mmachi azụmahịa ọ machiri mba Iran maka ngwaagha nuklia. N'egwuregwu, Onye so nwere otu bọọlụ Arsenal bụ Usmanov ekwetela ịnaara ego dị Paụnds nari ise na iri ise site n'aka ogbo ya bụ Stan Kroenke iji zụkọrọ otu Arsenal kpamkpam Kroenke nwere pasentị iri isii na asaa ebe Usmanov nwere naanị pasentị iri atọ n'ọnụ ego Arsenal. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Akwa ụzọ Nkwe na Ezere" afirika-43355302,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43355302,Uhuru Kenyatta na Raila Odinga ekpeziela,Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta na onye ndu otu pati na-ekwenyeghị n'ọchịchị ya bụ Raila Odinga ekwela nkwa ijikọakaọnụ kpaa udo maka ọdịmma mba ahụ.,"Raila Odinga (R) ekweghịbu nabata Uhuru Kenyatta (L) dịka onyeisiala mba Kenya Nke a na-estote ọgbahara sochiri ntuliaka e mere na mba ahụ n'afọ 2017. Uhuru Kenyatta na Raila Odinga kpọrọ onwe ha 'nwanne' na mgbasaozi na onyonyo televishọn ha gbakọrọ aka mee ụnyaahụ. Ọkwa ha mara mere ka odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Rex Tillerson gasịrị Kenya. Odinga duburu onwe ya iyi ọrụ dịka ""onyeisiala ndị ọha"" ma jụ ịnabata Kenyatta dịka onyeisiala ya N'okwu ya na Nairobi, Tillerson toro ụmụnwoke abụọ ahụ maka ""itupu ezi ụkwụ"". Mana , o kwuru na mba Kenya kwesịrị ""imegharị ụfọdụ ihe dịka imechị ụlọ mgbasaozi televshọn na itinye aka n'ihe ụlọikpe na-eme"". Na mbụ Kenyatta na Odinga ekwetaghị oku ndị Kenya na ndị na anọchịta anya mba ọzọ kpọrọ ha ka ha kpee udo. Ihe dịka mmadụ otu nari na ise ka e gburu na ntuliaka e mere nke Kenyatta meriri ka pati na-agba ya mgba jụchara isonye mee. N mgbasaozi ahụ ha nke abụọ jikọrọ aka mee, Kenyatta kwuru: ""Anyị ga-ebido usoro ịkpa ihe na-esogbu anyị na ihe na-ebute nkewa n'etiti anyị."" Odinga si :"" Oge idozi ihe na-esere anyị eruola"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Na nkọwa ya, onye ntaakụkọ BBC na Nairobi bụ Ferdinand Omondi kwuru na ụmụnwoke abụọ ahụ ikpezi ihe na-esere ha agaghị adị mfe n'ihi na esemokwu ndọrọndọ ọchịchị ahụ dapụtara kewara mba Kenya na agbụrụ na agbụrụ. Ha ekwuteghị maka ebubo pati na-anọghị n'ọchịchị na-ebo na e nwere wuruwuru, tigbuozọgbuo ndị uweojii na aka ike nke gọọmentị nọ n'ọchịchị na ntuliaka ahụ kama ha kpọrọ oku mkparịta ụka udo nke mba ha. Tupu Tillerson aga Kenya, ọ katọrọ gọọmentị nke mba Ethiopia maka iwezụga iwu ala n'ụsọ nke a kpọrọ 'state of emergency' na bekee n'ihi ọgbaghara dị na mba ahụ. Nke a mere ụfọdụ ji ahụta nzukọ mberede Kenyatta na Odinga mere dịka ihe mmekasị ndị mmadụ anya, ebe ụfọdụ nabatara ya sị na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime kemgbe. Ka ọ si dị, Kenya na-abanye ihe nkiri ndọrọndọrọ ọchịchị agba nke abụọ ma mba ụwa na-ekiri. Cheta na e duru Kenyatta iyi ọrụ nke agba nke abụọ n'ọnwa Nọvemba afọ gara aga ka ọ merịrịchara na ntụliaka mmegharị nke Odinga jụrụ isonye. Kenya meburu ntuliaka n'ọnwa Ọgọstụ nke ụlọikpe nyere iwu ka emegharịa n'ihi ebubo nrụrụaka jupụtara na ya." egwuregwu-46008209,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46008209,Leicester City: Ụgbọelu Helikọpta onye nwe ya akpọriela,Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ.,"Anya hụrụ ka ihe si mee sị na ọ bụ akụpe ọdụ ụgbọelu kwụsiri ịrụ ọrụ mere o ji kpọkasịa. Akụkọ kwuru na Vichai Srivaddhanaprabha bụ onye nwe otu bọọlụ Leicester City nọ n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ọ dara n'ala. Leicester City bụ ebe ụmụ Naịjirịa abụọ bụ Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a e mee. End of Twitter post, 1 Amabeghi mmadụ ole ọzọ nọ n'ime ụgbọelu helikọpta ahụ mgbe nke a mere. Anya hụrụ ka ihe ji mee sị na akụpe ọdụ ụgbọelu helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ nke mere o ji kpọkasịa. Onye ọzọ hụrụ ya kwuru na injini helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ tupu o si n'elu daa. Vichai Srivaddhanaprabha goro Leicester City n'afọ 2010 eruo n'afọ 2016 ha mabute Iko Premier League. Vichai Srivaddhanaprabha goro Leicester City n'afọ 2010 mana e rue n'afọ 2016 ha mabute Iko asọmpi Premier. Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu Manchester City na-ezigara ha ozi nkasi obi. Ndị ọzọ na-ezigara ha ifuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 50648746,https://www.bbc.com/igbo/50648746,Matthijs de Ligt: Ihe atọ ị maghị maka ọgbaa bọọlụ a,Matthijs de Ligt bụ onye ritere nzere iko Kopa nke afọ 2019 nke bụ nturuugo a na-enye ọkaibe na agbam bọọlụ ndị erubeghị afọ 21.,"Matthijs de Ligt bụ ọkaibe na bọọlụ ndị akarịbeghị afọ 21 KOPA bụ nzere otu egwu bọọlụ mba Fransi na-ahazi nke ndị riterela nzere ""Ballon d'Or"" gụnyere George Weah bụ onye isiojii mbụ na-erite zere ahụ na-ahọpụta. Ndị nwetarala nzere Kopa gụnyere Kylian Mbappe (PSG) n'afọ 2018, ebe Christian Pulisic ( Borussia Dortmund) nwetara ọkwa nke abụọ n'otu afọ ahụ. Lee ihe ndị ọzọ ịmaghị maka Matthijs de Ligt; 1. Onye Netherland, de Ligt onye a mụrụ n'afọ 1999 na-agbara otu egwu bọọlụ Juventus bọọlụ. 2. De Ligt eriteela ọtụtụ nzere gụnyere 'onye ndu (captain) kachasị bụrụ nwata' na ndụ otu egwu bọọlụ Ajax Amsterdam; nzere""Amsterdam talent of the year"" nke afọ 2017, nzere ""Johan Cruijff Prize"" nke afọ 2018 ; nzere ""Golden Boy"" Award nke afọ 2018. 3. Mmasị nwata nwoke a bidoro gbawara Ajax bọọlụ ka ọ dị afọ itoolu, bụbu na tennis. Akụkọ ga-amasị:" afirika-44617514,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44617514,D'banj ga-azara ọnụ ya n'ọnwụ nwa ya - Uweojii,"Na-erughị mkpụrụ ụbọchị abụọ nwa otiegwu bụ D'banj nwụrụ n'ime ọdọ mmiri dị n'ụlọ ya, ndị uweojii Naịjirịa akpọkuola ya ka ọ bịa zara ọnụ ya.","D'Banj anọghị n'ala Naịjirịa oge ihe a mere N'ime akwụkwọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti depụtara, o kwuru na ha zigara ndị ọrụ ha ka ha gaa mgbaru n'ụlọ D'banj dị n'Ikoyi, mana onweghị onye ha zutere n'ụlọ. Oti kwuru na kọmishọna ndị uweojii bụ Edgal Imohimi, chọrọ ka D'banj na ezinaụlọ ya bịa mee mkpesa ihe mere nwa ha nwoke ma ha ruchaa uju. N'akwụkwọ ozi ahụ, o dere ""Kọmishọna ndị uweojii nke Legọs steeti bụ Edgal Imohimi, n'ikwuchitere ọnụ ndị uweojii ndị Legọs steeti, chọrọ ikasi ezinaụlọ Oladapo Daniel Oyebanjo a ma dịka D'banj obi, maka ọnwụ nwa ha nwoke bụ Daniel Oyebanjo nke nta, onye ihe mberede ya mere n'ụbọchị 24/06/2018, n'ụlọ ha n'Ikoyi-Legọs. ""Kọmishọna chọrọ ka ezinaụlọ a mara na ndị uweojii sonyere ha n'oge iru uju a. ""N'agbanyeghị na ụlọọrụ anyị zigara ndị mmadụ nke CSP Mustapha N'Abba du, mgbaru n'ụlọ ezinaụlọ Oyebanjo n'Ikoyi ma onweghị onye ha zutere n'ụlọ ahụ, anyị na-atụ anya na oge iru ujuu ha gafechraa, ezinaụlọ a ga-abịa mee mkpesa ihe butere ọnwụ nwa ha nwoke bụ Daniel n'aka ndị uweojii. Ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa. Isee."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43773292,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43773292,Commonwealth Games 2018: Hawkins adaala,"Nwa amadị Scotland bụ Callum Hawkins gbara afọ iri abụọ na ise, onye gara inweta ọlaeedo ma ọbụrụ nọ o ruru na ngwụcha, a dala yọkọm n'ụzọ.","Hawkins gara inweta ọlaedo ma ọbụrụ na ọ gbara ọsọ rue n'isi Agbanyeghị 'ọnọdụ ekpomọkụ dị na mba Gold Coast, Hawkins ji nkeji abụọ gacha ndị ọzọ nke bụ na ọ gara inweta ọlaedo mana ụkwụ bidoro ịsọ ya ngọngọ tupu ya ada n'akụkụ ụzọ. O biliri ma ga n'ihu na-agbakwa ọsọ ọtụtụ nari mita tupu ọ da ọzọ kụọ isi n'ala. Hawkins mụ anya oge nke a mechara ma bilie na-ekwu okwu dịka e bubara ya n'ụgbọ nleta ahụike nke a kpọrọ 'Ambulance' na bekee. Akwụkwọ ọzi nke ndị otu egwuregwu mba Scotland wepụtara kwuru sị: "" E bugara Callum ụlọọgwụ dịka ọ dachara iji nyocha ya dịka e si eme ya. Obi dị anyị ụtọ ịgwa ụnụ na o kuliela, ebe ya na nna ya na ndị ọrụ nleta na-enwe mkparitaụka. ""A na-eme ya nyocha n'ihi adịghị amaama. Anyị na-ekpere ya ekpere ka ọ dịkwa mma ọsọ ọsọ."" Ogbo Hawkins bụ Steph Twell gbara ọsọ bịa ileta ya Peter Jardine nke Scottish Athletics kwara BBC na Scotland na Hawkins, onye gbarala ọsọ ihe karịrị elekere abụọ, ""jụburu ka enye ya nleta ahụike oge ọ dara n'ihi na ọ na-atụ uche nke a ga-eme ka agụpụ ya n' asompi ahụ"". O were nkeji ole na ole tupu ndị nleta ahụike erute nyere nwa amadi ahụ aka nke mere ka onye ntaakụkọ egwuregwu BBC bụ Steve Cram sị na ọ bụ ""ihe ihere"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48942601,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48942601,Abba women protest: Anyị chọrọ igbochi nsogbu n'etiti obodo Abba na agbataobi ha - Ndị Uweojii,Ndi Uweojii Anambra steeti ekwuola na ihe mere ha ji nọchie ahia ndị obodo Abba n'Anambra steeti bụ iji gbochie ọgbaghara n'etiti obodo abụọ gbara agbataobi.,"Ụmụnwaanyị Abba n'azụ ahịa n'akụkụ okporoụzọ dịka ndị uweojii were ọnọdụ n'ahị Oye-Abba n'Anambra steeti Ụbọchị Tuzde, ụmụnwaanyị obodo Abba tiri mkpu tigara gọọmenti steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ napụta ha n'aka ndị uweojii ndị ha boro ebubo iwakpo ahịa ha n'azụ kwa izu. Ha na-ebo ebubo na kemgbe izuụka abụọ gara aga ha bịara ahịa were hụ ka ndị uweojii kpojuru ahịa ma were ikuku anyammiri chụsaa ha ka ha siri ụzọ ọzọ banye ọdọahịa ha. Nchọpụta BBC mere na-arụ aka n'mgbochi ndi uweoji mere metụtara okwu ala dị n'etiti ndị Abba na ndị Ukpo bụ ndị agbataobi ha. N'ọsịsa sị n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nyere BBC Igbo, o kwuru na ""ndi ụweojii anọchighị ahịa ọbụla."" Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti "" Anyị nwetara ozi na ọgbaghara na-achọ ịda n'etiti obodo abụọ, anyị were ziga ndị ọrụ anyị iji gbochie ọgbagharan'ebe ahụ."" Akụkọ ga-amasị gị: Igbos in Egypt: 'Ị gaa Cairo, nri Igbo agaghị akọ gị'" afirika-51307393,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307393,Coronavirus: Ihe dị mkpa gọọmentị Naịjirịa na-eme ịgbochi ọrịa a,Coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ si na akụkụ Wuhan na mba Chaịna pụta egbuola mmadụ 170.,"Ka ọ dị ugbua, ọrịa ahụ eferela rue mba iri na isii ma jide kwa mmadụ 7711 na mba ụwa niile. E chere na o rutela mba Afrịka mana nwata akwụkwọ e chere na ọ nwere ya na mba Ivory Coast enweghi ya. Naịjirịa bụ ebe ọtụtụ ndị mba Chaịna na-abịa a zụ ahịa ya mere anyị ji jụọ ""Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme ijji gbochi ọrịa a"" ""Gbajọgodinu ụzọ Chaịna n'oge a"" Minista na-ahụ maka ahụike bụ Osagie Enahire agwaala ndị Naịjirịa ha kwụsịtụ njem mba Chaịna ugbua N'ọnụ ya ""ọ dịla mkpa ịgwa ndị Naịjirịa ha hapụ ị ga Chaịna sọsọ maọbụ okwu dị oke mkpa"". Nyocha ọdọụgbọelu dị icheiche Ihe ọzọ Enahire kwuru bụ na ebidola nyocha pụrụiche n'ọdọụgboelu ofesi niile dị na Naịjirịa. Ha gụnyere Abuja, Kano, Porthacourt, Enugu nakwa nke dị na Legọs. Ha kwuru na ha ahaziela ogige ebe ha ga-edobe ndị a chọpụtara na ha bu ọrịa ahụ maka nyocha. Njikọ aka maka ọdịnma ahụike ndị mmadụ Abike Dabiri-Erewa bu onyeisi ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ n'ofesi Ngalaba na-enyocha ọrịa na-efe efe bụ NCDC n'aha ịchafụ ekwuola na ha na WHO ejikọla aka maka ịluso ọrịa ọgụ. Cheta na WHO ekwubuola na ọrịa nwereike ifesa mbaụwa niile nke ha kpọrọ ""Epidemic outbreak"" na Bekee. Ebe Onyeisi Nigeria Diasposara Commision bụ Abike Dabiri kwukwara na onweghi onye Naịjirịa buterela ọrịa a na Chaịna. O kwukwara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ agaala n'ụlọọrụ Naịjirịa dị na Chaịna. ""Anyị na Ministri na-ahụ maka ndị ofesi ejikọọla aka ịma etu anyị ga-esi kpọpụta ndị tọrọ ebe ahụ"" ka o kwuru. Mana, otu nwata akwụkwo ya na BBC Igbo kpara nkata sị na onwebeghị onye ha hụrụ ma kwuo na ọ bụ agụ bụ isiokwu ha ugbua. ""Ndị Gana izitaala ha ego mgbachi akpa, mana anya anyị ahụbeghị ndi nke anyị."" Ọ gwakara n'ihu dụọ ndị Naịjirịa na-abịa Chaịna ọdụ maka nke a ma sị ka ha ghara ịbịa Chaịna ruo oge nje a lala." afirika-50402464,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50402464,FUTA: Anyị ga-ata ụmụakwkwọ wakporo ibe ha ahụhụ,Ndị isi 'Federal University of Technology Akure(FUTA) ekwuola na ha ga-ata ụmụakwụkwọ Mahadum ahụ na-emegbu nwata akwụkwọ nwaanyị ibe ha n'onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia ahụhụ.,"Ọnụ na-ekwuchitere Mahadum ahụ bụ Adegbenro Adebanjo n'ime ozi o zitere BBC kwuru na ha ga-enyocha ka ha chọpụta ihe butere ya bụ mmegbu karị were ndụ nwata nwaanyị ahụ akụrụ ihe. O kwuru na Mahadum FUTA na-ese ihu nye ya bụ agwa ma na-ekwu na ha ga-emeriri ihe niile iwu na-echekwa ụmụakwụkwọ kwuru gbasara ndị kpara agwa ọjọ a. Adebanjo kwuru na Mahadum ahụ na-eleta ya bụ nwata akwụkwọ nwaanyị etikasịrị ihe n'ụlọọgwụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ondo steeti bụ Femi Joseph kwuru na otu nwata akwụkwọ ọ gaghị akpọpụta aha ya kpọrọ ya gwa ya maka mmegbu a mana ọ dụrụ ya ọdụ ya kpesara ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla kachasị dị nso. Joseph kwuru na nwata akwụkwọ ahụ akpọbeghị ya gwa ya ma ọ gazikwara kpesa nke ndị ọrụ ya. SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya O kwuru na ọ bụrụ na ya bụ ihe mere n'ụlọ obibi ụmụakwụkwọ dị na Mahadum, ha ga-esi n'aka ndị isi FUTA nwuchie ya mana ọ bụrụ na o bi n'ụlọ n'adịghị n'ogige Mahadum, ha ga-eji aka ha ga nwuchie ya. O kwuru na etu o si na dị , ha ga-anwụchiriri onye kpara agwa ọjọ a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka onyonyo a na-efegharị Ohakwe Prince tinyere ọnụ n'okwu site n'ịkọwa ihe ọhụrụ n'onyonyo a. Cindy Oluchi kwuru na e kweisiri ịnwụchị nwoke mere ihe a. Blank kwuru na ọ bụrụ na anwụchịghị onye kpara agwa a na ọ ga-adị mma ka emechie FUTA. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu" afirika-51612605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51612605,Imo state Politics: Ihe mere m ji si na PDP wụbanye n'APC- Uche Ogbuagu,Onye nnọchite anya Ikeduru constutency n'ụlọomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu ekwuola ihe mere ọtụtụ n'ime ha jiri sị otu Peoples Democratic Party mafee APC.,"Imo state Politics: Ihe mere m jị si na PDP wụbanye na APC- Uche Ogbuagu Ogbuagu sị na ọgbaaghara karịrị na pati PDP mere ya na ndị otu ha ụfọdụ ji mafee APC. O kwukwara na PDP nọ n'Imo steeti kwụsitụrụ ya isonye n'otu ahụ maka ebubo na ya na ndị si pati ọzọ gakọrọ emume. N'okwu ya "" ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ agwọ na-erị nwa ha."" ""Otu ndọrọndọrọ ọchịchị m nọ na ya anaghị akwado m n'ihe m na-arụrụ ndị be anyị."" Gere ihe ndị o kwuru n'uju ebe n'ihe nkiri dị n'isi akụkọ a. Nke a na-abịa dịka otu onye ọkaiwu akpọrọ Nelson Okedinachi, kwuru ka achụọ onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti nakwa ndị otu ya si PDP na APGA wụbanye APC. O nwere iwu megidere isi otu ndọrọndọrọ wụbanye ọzọ? Onye ọkaiwu aha ya bụ Malachy Ugwumadu kwuru na ọ bụrụ na onye ụlọomeiwu si pati ọ nọ wụbanye pati ọzọ enweghị ihe gosiri na pati ya nọ n'ọgbaghara, ị marana a ga-anapụ ya oche n'ike n'ụlọomeiwu. Nke a bụ makana agwa a megidere iwu Naịjirịa dị na ""section 109 (1)(g) nke afọ 1999 ahaziri. Mana ọ bụrụ na onye ụlọomeiwu kọwara ọfụma etu pati ahụ ọ chọrọ isi na ya gbapụ si nọrọ n'ọgbaghara. ị mara na iwu ga-akwado ya nkeọma. Mgbe anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru PDP nọ n'Imo steeti, obughi ekwenti ya ruo ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'" 43021750,https://www.bbc.com/igbo/43021750,Mmadụ 104 n'Enugu North abụrụla ndi enweghị ọrụ,"Onye na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi chụrụ mmadụ 104 na-arụrụ ya ọrụ ka ihe bekee kpọrọ 'Executive Assistant', maka ha arụghị ọrụ ha etu ha kwesịrị.","Ugwuanyi bụ onye pati PDP, nke nọbụ n'ọchịchị na Naịjirịa Ugwuanyi, ka ọ na-ekwu maka ọchụchụ a ọ chụrụ ndị a, sị na ndị ọru, ọkachasị ndị si ebe a na-akpọ 'Enugu North Senatorial District', gbara ndebanye aha maka mbinye aka ndị na ahụ maka mbinye aka a na-kpọ INEC mere nkịtị. Ndị 'Executive Assistants' a si na ward 104 dị na Enugu North. Ugwuanyi sị ka ha ncha laghachị ward ha ga weta nkwado tupu ewegharịa ha n'ọrụ. Na ime ya, Gọvanọ Ugwuanyi sị na obi adighi ya mma etu ndị bụ bụ EA jiri hapụ ịhụ na ndị mmadụ mara maka ihe gọọmentị na eme, ọkachasi etu o siri metụta ndị nọ n'ime obodo. Ọ sikwa ka ndị ọnụ na-atụ nkụ na pati nakwa ihe banyere gọọmentị na-ahọpụta ndị nwere okwukwe ma achọwa ndị ga-agara obodo ozi na ward di icheiche." egwuregwu-49541414,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49541414,Africa Games 2019: Ụmụ Igbo kpokọtara ọla n'asọmpi,Ụmụ Igbo gosiri na ha bụ atakata a gbọọ dịka ha so kpokọọ ọla dị iche iche n'asọmpi Africa Games e mere na mba Moroko n'ọnwa Ọgọstụ 2019.,"Igbo nwere mmadụ n'ezie. Nke a gosiri onwe ya n'asọmpi a, dịka ha nọ na-atụtụ ọla n'akanri na akaekpe. Naịjirịa nwetara mkpokọta ihe nrite 127 n'asọmpi a, mana lee ndị Igbo so tụkọta ihe nrite ndị ahụ. Eze Joy Ogbonne N'afọ naanị 15, o debanyela aha ya n'aha a gaghị echefu ọsịsọ n'ụwa asọmpi ibuli igwe Naịjirịa. Ogbonne a mụrụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun 2004, gara asọmpi ahụ bụrụ 'agụ'. Nwaada a kpokọtara ọlaedo atọ. Ọ bụ onye Ebonyi steeti. Amalaha Joy Chika A machiri ya isonye n'egwuregwu a afọ abụọ n'afọ 2014 iji taa ya ahụhụ maka ọgwụ ike a chọtara n'ahụ ya Amalaha a mụrụ ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba 1997, ji aka na-ekpokọ ọla n'asọmpi ibuli igwe e ji akpụ ụzụ. O nwetara otu ọlaedo na ọlaọcha abụọ na nke afọ 2019 a. N'afọ 2014, o nwetara ihe nrite ọlaedo n'asọmpi Commonwealth, mana a napụrụ ya mmeri ahụ makana a chọtara 'ọgwụ ike' n'ahụ ya. Ọ bụ onye Abịa steeti. Kalu King A mụrụ ya n'Enugwu steeti Kalu a mụrụ ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1995, tụtụchara ọla atọ a na-enye n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara otu ọlaedo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara. Ọ nọchitekwara anya Naịjirịa n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2014. Eke Uche Devon Ọ bụ onye Naịjirịa mbụ na-enweta ọlaedo na ""gymnastics"" n'asọmpi All African Games Eke a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọgọstụ 1997, nwetara ọla abụọ n'imegharị na ịgbatị ahụ nke a kpọrọ 'Gymnastics'. O nwetara otu ọlaedo na otu ọlanchara. Ọ bụ onye Amaukwu, Imo steeti a mụrụ na mba Amerịka. Akano Desmond Akano a mụrụ ụbọchị 30 nke ọnwa Septemba 1997, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara ọlaọcha abụọ. Ọ bụ onye Imo steeti. Nwaokolo Augustina Nkem Nwaokolo a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba 1992, nwetara ihe nrite atọ n'asọmpi ibuli igwe. O nwetara ọlanchara atọ. O ritekwara ọlaedo n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2010. Ukeh Uchechukwu Deborah Ọ bụ onye Enugwu steeti Ukeh a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba 1996, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi 'Badminton'. O nwetara otu ọlaedo na otu ọlaọcha. Ọlaọcha ya bụ nke ya na Dorcas Adesokan so pịata. Ndị a niile bụ ndị nwetara ihe nrite karịrị otu. Ndị Igbo ndị ọzọ sokwa nweta ihe nrite dịka n'ọsọ, bọọlụ nakwa egwuregwu ndị ọzọ. Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: International Women's Day: 'A naghị akwado bọọlụ ụmụnwaanyị ọfụma'" 45911049,https://www.bbc.com/igbo/45911049,Osisioma: Ọkụ gbara wutere Buhari nke ukwu - Garba Shehu,Ọnụ na-ekwuchitere Buhari esila n'akara ozi ya na Twitter zipụ ozi maka ihe mberede mere n'osisioma ebe ọkụ mmanụ agbidi gbagburu ọtụtụ mmadụ.,"End of Twitter post, 1 O kwukwara na ihe ọdachị ahụ malitere mgbe ndị gara ohi mmanụ bidoro ịlụ ọgụ n'ime onwe ha nke kpatara na agbapụrụ egbe, mmanụ were nwuru ọkụ gbagbuo ndị mmadụ. O kwuru na oteela aka ndị a na-emebi okporo mmanụ na-enye gọọmentị nsogbu nakwa na ha jisike eme ya n'agbnyeghị na adọọla ha aka na ntị ha kwụsị ya. Obi adịghị Ohaneze ndị Igbo mma maka etu esi neni ndị Igbo na Naịjirịa Cheta nd ndị ọchịchị ohaneze ndị Igbo mbaụwa niile rịọrọ onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ka ọ ṅyomie onye bụbụ osote onyeisala na Naijirịa, aha ya bụ Atiku Abubakar site na ịga leta ndị ọkụ gbara n'Abia steeti. Ụbọchị Oktoba iri na abụọ ka ọkụ gbara ọtụtụ mmadụ karịrị iri na ise n'Osisioma di n'Abia steeti. Ndị a gụnyere ndị agha, nwaanyị kụ nwa n'aka nakwa dị na nwunye nọ n'ulọ ha. Peter Obi bụ onye ya na onye na-azọ oche onyeisiala na pati PDP, Atiku Abubakar gara n'aha Atiku ga leta ndị a ọkụ gbara ma nye ha ma kasie ndị ihe a metụtara obi. Atiku nyekwara ha ego ruru nde naira iri ka wee nweretụ onwe ha. Abia fuel explosion: Di na Nwunye bi n'ụlọ m rere ọkụ N'ime akwụkwọ onyeisi Ohaneze bụ Okechukwu Isiguzoro depụtara ndị ntaakụkọ, otu ahụ kelere Atiku maka etu o si gosi obioma ya na ebe ndị ihe mberede a mere. Ha jikwa ohere a dọọ aka na ntị maka ndị na-esi azụ ezu ụgbọala ha kwụsị ya makana ha na-eche na onwere ike ị bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba. N'okwu ha, ""Ohanaeze ndị Igbo mbaụwa niile na-akpọkụ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ gaa leta ndị ọkụ gbara n'Osisioma ka o wee chọpụta etu esi ezu mmanụ ụgbọala na steeti ahụ mamee ihe maka ị kwụsị ya. Nke a ga-emedata obi ụmụ Igbo a na-ekwu na anaghị emeta ọfụma."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53442924,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53442924,Anyị ka na-eche ego ije kpe udo na nghọtaghie okeala Ebonyi na Benue - National Boundary Commission,Ọgbaghara si n'okwu ndọrọndọrọ ala dapụtara n'obodo ise dị n'Ebonyi steeti achụpụla ndị mmadụ na be ha.,"Okwu a dị n'etiti ndị okpuruọchịchị Ohaukwu nakwa ndị okpuruọchịchị Ado dị na Benue steeti bụ nke na-akpọtụ kemgbe afọ ole na ole gara aga. Onyeomeiwu nọchitere anya Ohaukwu n'ụlọomeiwu Ebonyi steeti bụ Chinedu Onah ebela akwa arịrị gbasara ya bụ okwu. O kpọrọ oku ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ enyemaka iji kwusị oke ogbugbu nakwa imefu ndụ si na ya bụ okwu apụta. Chinedu Onah yi akwa 'ishiagụ' bụ onye na-anọchịte anya Ohaukwu n'ụlọomeiwu Onah kọwakwara na ndị ahụ gbara ọsọ ndị enweghi ebe ọbụla ha ga-edebe isi ha maọbụ ihe oriri ha ga-eri. ""Mmefu ndụ, ngwa obibi nakwa osisi ndị na-amị ego na-eme ebe a na-ewute anyị n'obi"" ka o kwuru. Ọ na-akpọku gọọmentị etiti ka ha kpọbata ndị 'National Boundary Commision' iji kpebie udo n'ala ahụ ọfụma ka esemokwu an ogbugbu dị n'ime ya kwụsị. Mana ndị ọrụ ngalaba NBC kọwarala BBC n'ekwentị ihe ji nkịta ọnwụ. Austin Omale na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ onyeisi NBC kọwara na ọ bụ ego ji ha ịrụpụta ọrụ dị n'ike oke ala ahụ ọfụma. O kwuru na o teela aka ngalaba ya na-eche ka gọọmentị eititi wepụta ego a ga-eji ga Ebonyi steeti ruọ ọrụ a. ""Kemgbe ọnwa Septemba afọ 2019 ka anyị na-eche ka ego a ruo anyị aka mana o nwebeghi isi"" ka o kwuru. O kwukwara na mgbe ikpeazụ ha gara ebe ahụ ịrụ ọrụ na ndi obodo dị nso ebe ahụ wakporo ha. Okwu ala ataala isi mmadụ abụọ n'Ebonyi Mmadụ abụọ anwụọla ebe ọtụtụ ihe ndị mmadụ mebiri dịka okwu ala dapụtara n'etiti ndị obodo Nguji Ojiegbe Onunwakpu na ndị Ndiegede nke dị na Igbeagu, dị na mpaghara okpuru ọchịchi Izii, Ebonyi steeti n'ụbọchị Wenesde. Akụkọ na-akọwa na esem okwu a bidoro kamgbe afọ 2012. Onye ntaakụkọ gwara BBC na mmadụ abụọ aha ha bụ Sunday Odom, dị afọ iri abụọ na anọ bụ onye obodo Onunwakpu, na Emmanuel Uguru nke Ndiegede bụ ndị nwụrụ n'ọgụ gbasara ala a. Ọ bụ n'ịzuụka abụọ gara aga ka kọmịshọna na-ahụ maka oke ala na iweta udo bụ Stanley Okoro Emegha nke Ifeanyichukwu Igurube nọchịtere anya ya bịara njem nyocha na ntule ya bụ ala na-ese okwu ma gwa ndị obodo abụo a ka ha wepụ aka n'ala ahụ tupu gọọmenti ekpebie maka ya. Otu onye nwa ya nwụrụ bụ Odom Abama kwuru na-egburu nwa ya nwoke na-agbanyeghị na o bụghị onye obodo ndị a na-ese okwu a. Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti Abama kwuru na nwa ya nwoke na nwanne ya nwaanyị gara ubi dị nsọ ala ahụ na-ebute okwu mgbe ndị okorobịa a na-ache na ha bụ ndị Ndiegede gbara ya egbe n'afọ. O kwuru sị "" A nọ m n'ubi mgbe m nụrụ ozi na a gbara nwa m nwoke egbe, nwa m ka lụrụ nwaanyị nsonso a ma mụa kwa nwa nwaanyị. Gọọmentị biko gbatara anyị ọsọ enyem aka"". Be onyeisi obodo emebiri Abama kọwara na-akpọrọ nwa ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ. Eze Ogbodo Onunwakpu bụ Mbam Nwambam Ekpem, kwuputara na obi adịghị ya mma dịka ihe ndị obodo ya gabigara na ya bụ esemokwu. Ọ sịkwa na ha na ndị obodo Ndiegede enweela nghọtahie ala mbụ kama ha doziri ya n'udo. Etu e si wakpo ma gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti Ekpem katọrọ etu ndị ntoroọbịa siri lụsa ụmụnne ha ọgụ ma rịọ ka Gọvanọ Ebonyi bụ Dave Umahi gbtara ha ọso enyem aka. Mazị Ominiyi Febian onye bụkwa onyeisi n'obodo Nguji kwuru na agbara ụlọ ya ọkụ ma mebie ubi osikapa ya. Odom Abama bụ onye egburu nwaya nwoke dị afọ 24 O kwuru sị "" Ọ bụ n'ụbọchị wenesde ka m sị ubi alọta mgbe m nụrụ ụda egbe, a gbahachịrị m azụ. Ọ bụ ka ebe niile dere duu ka anyị chọpụtara na-agbara ụlo niile dị na Azungele ọkụ"". N'otu aka ahụ, onye ode akwụkwọ otu a kpọrọ ""Igbeagu Stakeholders Forum"" katọrọ ihe mere ma sị ka gọọmentị gbatara ha ọsọ were dozie ya bụ esem okwu. Ka nke a na-eme ka Eze obodo Nguji Ojiegbe bụ Innocent Igbeagụ kagburu ya bụ ọgụ dị n'etiti obodo abụọ a ma kelee ngalaba na-agba mbọ ihu na ewetara udo n'etiti ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bu Loveth Odah kwenyere na mwakpo mere, mana ọ sị na ọ bu otu nwoke di afọ 75 nwụrụ site na ya. Ọ sị na a na-achọbu nwoke ahụ, ma mechaa hụ ozu ya." 45205147,https://www.bbc.com/igbo/45205147,Ndị uweojii anwụchiela ojiegbeezu gara zuo agbataobi ya,Nwoke a kpọrọ Taoheed Adegbite bụ onyenweụlọ duru ndị otu ya gaa ohi na ngwuru onye agbataobi ya ebe ha buru ụgbọala ya gbaa ọsọ.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ogun steeti bụ DSP Abimbola Oyeyemi, kwuru na ndị ojiegbeezu zuru ụgbọala SUV nke agbataobi Taoheed ma bụrụkwa onyenweụlọ dịka ya. Onye ihe ahụ metụtara gwara ndị ntaakụkọ na ndị omekome a wakporo be ya bido na-agba egbe. ""Echere m na ọ bụrụ ma ha bata, na ha nwere ike imerụ m ahụ maọbụ gbuo m. ""Ya mere m jiri jụọ ha ihe ha chọrọ. Ha kwuru na ha chọrọ ụgbọala m. ""Esiri m na mpio ghapụrụ ha igodo ụzọ m. ""Ha gbanyere ya mmanụ ụgbọala kwọrọ ya gbapụ."" Nwoke ahụ bekuru ndị uweojii ndị ji ozi o wetara ha chọwa ndị mere ihe ahụ ma nweta ha. Ọ bụ oge ha kpọrọ nwoke ahụ oku ka ọ bịa na a hụla ụgbọala ya ka o rutere ọ bụrụ na ọ bụ onyenweụlọ dịka ya ma bụrụkwa onye agbataobi ya kpara mkpamkpa ihe ahụ. Oge a gbara ya ajụjụ nwoke ahụ a na-enyo enyo, ajụjụ, ọsaghị ya n'ihi na ọ nọ n'ihe mgbu egbe ndị uweojii gbara ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-47824829,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47824829,Trevor Noah: Kedụ nke bụ ịgafe Italy gawa Britain ịzụ pizza?,Ọ bụ ihe ọchị ka ọ bụ akwa na ụwa jizi Naijiria eme ihe ọchị maka ịtụbata ihe ndị enweghị isi site na mba ọzọ?,"Obi adịghị ụmụ Naijiria mma maka njakịrị ọkpaọchị Trevor Noah mara ha maka ịtụbata pizza sị mba Briten Ọkpaọchị mba South Africa bị ala bekee bụ Trevour Noah sị na ya aghọtaghị ihe mere ndị Naijiria ga-eji na-agafe mmiri na asaa, mba na asaa iji ga zụọ achịcha bekee a kpọrọ pizza na mba Briten. Noah onye kwuruuru nke n'ihe onyonyo ọ na-egosi a kpọrọ 'Daily Show' jụrụ,"" Kedụ nke bụ ịga Briten, ebe i nwere ike ịzụ pizza na Italy?"" Nke a na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka orugbo bụ Audu Ogbeh tụrụ arịrị n'ihe onyonyo sị na ụmụ Naijiria ụfọdụ na-atụbata pizza ma were ụgbọelu 'British Airways' ebubata ya. Njakiri ahụ na-ewu na soshal midia dịka ọ gbarụrụ afọ ọtụtụ ndị Naijirịa ndị kwuru na okwu ahụ atọghị ha ọchị ma ọlị. @MydearVic kwuru na njakịrị ahụ kpọọ nkụ karịa achịcha. @ Dad_dyPaul kwuru na kama Noah ga na-ekpuchi Afrịka ọ na-agba ha n'anwụ. Mana ụfọdụ dịka @telesthesiatats na @VillageGirl___ kwuru na njakịrị ahụ tọrọ ezigbo ọchị." afirika-45649292,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45649292,Fada Katọlik sị na igbochi afọime megidere iwu Chukwu,Taa bụ ụbọchị mbaụwa na-eme emume gbasara ụzọ dị icheiche e ji egbochi afọime oge mmadụ achọghị ya.,"Ihe ndị a bụ ihe a na-akpọ 'World Contraception Day' na Bekee. E ji ụbọchị taa agbasaozi gbasara mkpa ọ dị ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-enwe mmekọrịta anụ ahụ ịmata ụzọ dị mma iji gbochie afọime ghara inwe nsogbu ahụike. Ụfọdụ ngalaba dị icheiche na okpukpe dị icheiche machiri igbochi afọime na ime ihe ga-akwụsị nwaanyị itu ime. Ihe ụka Katọlik kwuru Ngalaba ụka Katọlik kwenyere ka di na nwunye mụta nwa oke ha ga-azụlị mana ha ga-agba mbọ hụ na ha egbochighi afọime ọbụla. BBC Igbo gbara Fada Ọkammụta Edwin Obimma Ezike ajụjụ gbasara ihe ụa Katọlik kwuru maka igbochi afọime. Fada Ezike kwuru na ụka Katọlik akwadoghi ka nwaanyị kwụsị afọime ọbụla nwoke gbanyegoro ya n'ahụ. O kwuru na nke a bụ maka na oge mkpụrụ nwoke banyere nwaanyị n'ahụ, mkpụrụ ahụ na akwa nwaanyị bịakọọ ọnụ, ndụ amalitela nke bụ na ihe ọbụla e mere ịkwụsị ndụ ahụ bụ imemina mmadụ. Lee ihe Fada Ezike kwuru ebe a: Igbochi afọime N'akụkụ nke ya, dibia Bekee bụ ọkammụta Uche Nwagha, bu ọkammụta n'ihe banyere ọmụmụ nwa na ụmụnwanyi, gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa na nwaanyị gbochiri ime oge ọ na-achọghị ya. O kwuru n'ezie na ndị ụka anaghị anabata ya mana ọ bụ ihe dị mkpa iji hazie ezinaụlọ na ụmụ ole di na nwunye chọrọ ịmụta. Uru atọ igbochi afọime bara Ọkammụta Nwagha gụpụtara ụfọdụ uru dị icheiche igbochi afọime bara. Ha bụ: Lee ihe ọkammụta ahụ kwuru ebe a: Igbochi afọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ Ezie, ndị ụka ekwenyeghi n'igbochi afọime mana ha nwereike ịnabata ya naanị oge ọ na-amaja ndụ nwaanyị. Dịka Fr. Ezike siri kwuo; ""N'oge a, anaghị egbochi afọime kama, a na-azọ ndụ."" Nke a pụtara na ọbụrụ na nkwenye mmadụ ekweghi ka o gbochie afọime, ọ ga-akpacha anya oge ọ na-emetụta ndụ ya, Akụkọ ga-amasị gị" 42816413,https://www.bbc.com/igbo/42816413,'Anyị ga-agbachi ụlọọgwụ a ọbụrụ na azaghị anyị' - Ndị ọrụ,"Nsogbu ndị ọrụ ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric dịna enugwu ewerela ọnọdụ ọzọ, dịka ha kpọkuela Gọọmenti etiti ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ n'ime otu izụka ma ọ bụ ha mechie ụlọ ọrụ ahụ.","Ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric bụ ebe ana-eme nyocha gbasara ọrịa isi mgbaka Iwe ndị ọrụ ahụ dina ebe onye Diratọ na-ahụ maka ahụ ike bụ Jojo Onwukwe nọ maka oke mmebi ọnọdụ ụlọọgwụ ahụ nke gunyere mpụ, nrụrụaka, ọchịchị aka ike na nleda anya usoro ọrụ. Ndị otu Joint Health Sector Union (JOHESU) nke ụlọ ọgwụ ahụ dere akwụkwọ mkpesa ma nye onye Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Oka nmụta Isaac Adewole izu ụka abụọ iji lebanya n'okwu ahụ. Ihe rụtụrụ aka n'akwụkwọ ahụ gunyere: Mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara otu onye Dọkịta n'ụlọ ọrụ bụ Ugwuonye ajụjụ ọnụ, ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na-enwere nsọgbụ n'ụlọ ọgwụ ahụ mana ọ bụ ndị otu JOHESU dere akwụkwọ mkpesa ahụ. Onye ọde akwụkwọ ukwu otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Ejike Ihezue mgbe agbara ya ajụjụ ọnụ rụtụrụ aka n'ihe ndị ahụ ede pụtara dịka iwe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ. O kwu kwara na onweghị ikike iwepụta akwụkwọ mkpesa ahụ edegara onye Mịnịsta na-ahụ maka ahụike. Mbọ niile agbara i nweta onye Diratọ ụlọ ọgwụ ahụ bụ Jojo Onwukwe n'ekwe ntị adịghị ire dịka ọ naghị aza ekwe ntị ya." afirika-43837531,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43837531,Ndị na-anata ọgwụgwọ ejichiela ndị dọkịta n'Enugu,Ndị na-anata ọgwu n'ọlụọgwụ ebe a na-agba ọkpụkpụ n'Enugu bụ nke akpọrọ National Orthopaedic Hospital na Bekee nwụchikọrọ ndị na-elekọta ha anya taa maka nkwụsị ọrụ.,"Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ na-eme alụkwaghịm Ndị ntaakụkọ gara ụlọọgwụ a kwuru na ndị a na-agba ọkpụkpụ na ndị metụtara ha gbachiri ọnụ ụzọ esi aba n'ụlọọgwụ ma mee ka ọnweghị onye bara n'ime ya. Ụfọdụ n'ime ndị a na-anata ọgwụgwọ kwuru na a sịrị ha laa. Ha kwukwara na ha akwụghị ụgwọ ha ji maka na ha ahụghị ndị na-ana ego, nke mere ka ndị nche gbochie ha mgbe ha chọrọ ịla. Ha sịrị na ndị nche a chọrọ ka-egosi akwụkwọ eji gbapụta ha n'ụlọọgwu ahụ. Otu onye na-anata ọgwụgwọ na-achọghị ka-amata aha ya sịrị na ọ bụrụ na ndị isi ụlọọgwụ ahụ akwanyeghị ụfọdụ ndị ọrụ ọkụ n'ike, o nweghị onye ga-aza ha. Ọ gara n'ihu kwuo: ""Ọ bụ onyeisi bịara ịnyere anyị aka na mgbede tọsday mana ọ maghị ebe akwụkwọ anyị dị. Ụfọdụ n'ime anyị na-anwụzị anwụ mana anyị enweghị ike ị ga ụlọọgwụ ọzọ ma ọ bụrụ na anyị akwụghị ụgwọ anyi ji ebe a."" Cheta na ndị ọrụ ụlọọgwụ so na ngalaba akpọrọ Joint Health Sector Union (JOHESU) na Bekee, bụotu jikọtara ndi na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nke gọọmentị nwere, bidoro arụkwaghị m kamgbe ubọchị Wenesde nke izuụka a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" afirika-49189398,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49189398,Gọọmentị Imo state ma maka akpụrụakpụ Rochas a na-akwatu - Ọnụ na-ekwuru Ihedioha,Ọ dịzị ka ọ bụ chi foo ụtụtụ ọbụla a nụ maka ihe a kwaturu n'Imo steeti mana gịnị ka gọọmentị steeti ahụ nwere ikwu maka ya?,"BBC Igbo kpọkuru Steve Osuji bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi nke Gọvanọ Emeka Ihedioha, onye kwuru na uche gọọmentị dị n'ihe na-eme. Osuji kwuru na a kwaturu ụfọdụ ihe dị n'ọgbọ ebe a kpọrọ ""Freedom Square"" makana ọ nọghị n'atụmatụ e mepụtara maka ebe ahụ n'Imo steeti. Ihe a kpụrụakpụ a kwụbụ dịka ugwu n'ọgbọ Freedom Square Osuji kwuru na e wepụtara ebe ahụ a na-akpọ Concorde Boulevard ka ọ bụrụ ebe ahịhịa ndụ a haziri ọfụma ga na-eto, na ọ bụghị ebe e dewere ka okwute nọrọ. O kwuru na gọọmentị ha ka ga-akwatucha ihe niile gọvanọ chịburu achị bụ Rochas Okorocha rụrụ na steeti ahụ, nke nọchiri ụzọ Concorde Boulevard ahụ maka na ọ bụ ebe e wepụtara ka a kụọ osisi na ahịhịa na-eme ka ụzọ maa mma. Ọ jụrụ sị ""kedụ ihe Rochas jiri ego Imo steeti rụọ dị mma Ihedioha kwaturu?"" na ọ bụ naanị ndị nke adịghị mma ka ọ ga-ewepụ. Gọọmentị ọ ma maka ""akantị a gbara nwa Rochas""? Osuji tinyekwara ọnụ n'okwu nwa Okorocha bụ Uloma Nwosu akụkọ kwuru na a gbara ya akantị ka ya na ndị ọrụ nnakọta (task force) zutere. O kwuru sị na gọọmentị akwadoghi mmadụ iji mmegide napụta onye ọzọ ihe, ọkachasị etu a na-achọ ịnapụta ihe ndị ha sị na Rochas Okorocha na ndị otu ya 'zuru' n'oge ọchịchị ha. O kwuru na gọọmentị ha ga-anakọtacha ihe niile Okorocha ""zuru"" tupu ha agawa ụlọikpe ịma ma aka ha adị ọcha maọbụ ọ dịghị. O kwukwara na ha ga-esi ụzọ ziri ezi mee ihe ndị a, makana gọọmentị nwekwara ikike ime nke a. Cheta na a malitere ịkụda ""Akachi"" bụ ihe a kpụrụ akpụ n'Owere, mere ka ndị mmadụ na-ajụ onye zitere ndị bịara kụtuo ya. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha" afirika-56411311,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56411311,Banga Soup: 'Emele m ka ọ dị gị mfe isi ofe akwụ na nkeji 20',"Akwụ bu otu n'ime ihe e ji esi nri n'ala Igbo ọkachasị, ofe akwụ.","Mana, ụfọdụ usoro e ji emedo ya bụ mmanụ ndị mba mmiri na-akpọ banga (palm nut oil) na-ahịaahụ. Ọ bụ ihe a mere ka Udoka Ugwu malite imepute nkwa nri akwu e ji ete ofe akwụ ịme ka ọ dịịrị ndị mmadụ nfe. Odoziakụ Ugwu na-agbanye akwụ a n'ime akpa tupu o ree ya. Ọ bu oge mmachi ngagharị n'afọ 2021 ka ọ malitere njem a iji nwete obele ego dịka ọ dị ime n'oge ahụ. Kiri akụkọ ya n'uju." afirika-47716529,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47716529,Inec Certificate of Return: Emeka Ihedioha na Ifeanyi Ugwuanyi anatala asambodo,Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enwetala asambodo mmeri ịlaghachite dịka gọvanọ steeti ahụ.,"Ipeazu acibuola Abia steeti afọ anọ garaaga Ọ gwara ndị ya na ya so zọ ọchịchị na ya ga-anabata akọ n'uche ha gbasara iwulite steeti Abia. Ikpeazu kwuru na ya ga-eme ka Abia ka mma karịa ka ọ dị mbụ. Ọha Enugwu majuru n'ụlọ ọrụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commision (Inec) iso na-emume okike asambodo Bekee kpọrọ ""Certificate of Return"". Aka na-achi steeti ahụ bụ Ifeanyị Ugwuanyi sọ na ndị bịara ya bụ njem. Onye no n'isi oche na ya bụ emụme bụ onyeisi ndị Inec n'Enugwu bụ Emeka Ononammadụ, na mmalite, sị na isiokwu tata bụ ịnye asambodo n'aka ndị ritere ya. Ọ sị na ya kwere nkwa mgbe ya bidoro ọrụ na ya ga-emepe aka ya na obi ya na-enweghị mmegbu ọbụla. Ọ sịkwa na ya bụ nkwa abịala na mmezu tata. Ononammadu sị na ya ga-enyocha ihe niile emere na ya bụ ntuliaka ịmụta n'ihe gara nke ọma ma hapụkwa nke adịghị mma. Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec na gọọmenti eititi kelere ndị niile nwetere merie ma sị na asambodo a bụ iji kwuo na emechela ntuliaka ma nyekwa ha ikike ịmalite ịgbara ndị wepụtara ha odibo. dịka iwu sị kwuo. Ọ sị na mmemme bụ mmechi iji gosi na ntuliaka agaala. Ka ọnatachara asambodo ya, Ugwuanyi gụrụ egwu ekele nye Chukwu. Ndị nwetere asambodo tata Okwu chinedu - Aniri Jane Chinwendu Ene - Agwu North Chukwuobasi Okwudili - Awgu South Edward Ubosi - Enugwu East 1 Ugwu Hillary Nkemdili - Enugu East 2 Onoh Marcus - Enugu North Sam Ngene Okechukwu - Enugwu South 1 Ugwu Mary Onyinye - Enugu South 2 Obienze Chima - Emmanuel Ezeagu James Okereke - Igboetiti East Ezeani Ezenta Ugochukwu Igboetiti Ethel Oyibo Ugwuanyị Igboeze North 1 Innocent Ugwu Emeka Igboeze North 2 Madu Emeka Linus Igboeze South Ugwueze Chijoke - Nnamani Isiuzo Val Nnajiofo - Nkanu East Iroabuchi Desmond - Nkanu West Nwamba Christain Chinedu Nsukka East Emma Ugwu Nsukka West Geofrey Ananyo Mba - Oji River Ezeugwu Ikechukwu - Udenu Ugwu Calistus Uche - Udi North Ene Chukwuka - Udi South Josephat Emmanuel O - Uzouwani Tata bụ wenezde mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachi bụ ụbọchị akara aka n'Imo steeti maka ịnye ndị meriri na ntuliaka 2019 asambodo ha bụ ike gosiri na ha nwere ikike ịnọchịte anya ndị ọgbọnta vootu ha. Emeka Ihedioha na ndị ọzọ Inec kwuru na ha nwere mmeri na ntuliaka emere n'ọnwa Febrụwarị nke afọ a. Nke a mere na ụlọọrụ Inec nke dị n'Owerri. Lee ka o si ga ebe a: BBC ekwuolara Ngozi Obiefule na-anọchite anya ọgbọnta vootu Isu ya na Eddy Obinna bụ onye na-anochite anya ndị Abo Mbaise bụ onye sị na ya ga-eme ka ọgbọnta vootu ahụ bụrụ elụigwe n'ụwa. Onye osote Gọvanọ bụ Alphonsus Gerald Irona sọkwa n'ime ndị natara asambodo nke ya. Egwu dapụrụ ndị na-akwado Ihedioha n'ọnụ mgbe akpọrọ ya. "" ...Ihedioha don come o . I no go gree, I no go gree dey for your hand' Ọha pụtakwara n'uju mgbe Emeka Ihedioha dapụtara ka ọnatachara asambodo ya. O sị na ntuilaka ahụ wepụtere ya bụ nke emere nke ọma. O kelere Onyeisi ụlọọrụ Inec maka mbọ ọgbara. O kwụrụ na ọchịchị ha ga a bụ ezigbo ọchịchị bụ nke ga-akwenyere iwu obodo ụgwụ. Uche Ogbuagụ bụ onye nnọchite anya Ogbonta vootu Ikeduru gwara BBC dịka onye so nata asmbodo n'ụbọchị tata na obi dị ya ụtọ. Naani ụmụnwaanyị abụọ so na ndị nwetere asambodo tata n'Imo steeti. Ụfọdụ ndị nwetere asambodo tata Ejiogu Phillip Dominic Ezerioha Nwaneri Reginald Ekene Fegolis Iwuanyanwu China Chimezie Collins Njoku Michael O. Uche Ogbuagu Paul Eleziem" 52649054,https://www.bbc.com/igbo/52649054,Jamb Result: Ndị Imo steeti kachasị 'agba mgbọ' n'ule Jamb,"Ozi ọhụrụ pụtara n'aka ngalaba na-ahazi ule bụ JAMB na-egosi na Imo steeti bụ ndị kachasị ""aghọ aghụghọ"" n'ule Mahadum ahụ.","Ihe kariri ọkara ụmụakwụkwọ Mahadum niile dere JAMB tupu ha banye Mahadum dị iche iche Ndị ejidere bụ ndị Imo ruru mmadụ iri abụọ na asaa ebe Anambara ji mmadụ iri na isii soro ya n'azụ. Steeti ndị ọzọ gụnyere: mmadụ iri na ise si Enugwu, Kaduna nakwa Kano steeti. Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba ahụ bụ Fabian Benjamin gwara ụlọ ntaakụkọ The Nation na akpụpụla ụfọdụ n'ime ndị ahụ ụlọikpe. ""Anyi na-eche ka ọrịa Coronavirus na ihe so ya laa tupu anyị amalite ị kpee ndị ahụ ikpe ọzọ"" ka o kwuru. Ndị ahụ niile e jidere ruru otu narị na iri itoolu na ise n'aha mmehie dị icheiche gụnyere: izobata Teknụzụ n'ime ule, i lere onye ọzọ ule, ịbute gbagharịa nakwa ịkpa nkata ịghọ aghụghọ n'ụlọ ule. ""Tọghapụnụ Leah Sharibu!"" A tọghapughị Leah Sharibu mgbe atọghapụrụ ibe ya Ọtụtụ ndị mmadụ na Naijiria nakwa na mba ụwa akpọọla oku ka gọọmenti mee ka Leah Sharibu, nwa ada ndị Boko Haram ji kemgbe afọ 2018 maka ịjụ ịghọlahu Kraisti. Taa bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Mee ka o mere afọ iri na asaa a mụrụ Leah mabụrụkwa afọ atọ ọ nọrọ n'aka ndị Boko Haram. WHO akwadola ịkpọpụta ndị ọrụ ha na Burundi Ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO ekwuola na o dobeghị ha anya ihe mere mba Burundi jiri chụpụ onye nnọchite anya ha ebe ahụ nakwa mmadụ atọ na-arụrụ ha ọrụ. Cheta na n'ụbọchị Tọzde gọọmentị mba Burundi si Walter Kzadi Mulombo,onye ọrụ WHO na mba ahụ na ndị ọzọ na ha achọghịkwa ha n'ala ha. Ndị mba Niger egbuola ndị Boko Haram 75 Ndị mba Niger ekwuola na ha egbuola ndị ogbu aṅụ ọbara bụ Boko Haram na Mpaghara Diffa nke dị nnukwu ọdọ mmiri Chad. Nke a bụ site na mbọ ha gbara nke gbara mkpị i ji megide ndị otu oyi egwu niile na mpaghara ahụ. Nke a na-eme dịka ụbọchị atọ gachara ebe ndị otu oyi egwu ọzọ eche na ha na ndị otu IS gba gburu ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'obodo dị n'ọke Niger na Mali. Nwoke tụwara nwa ya ime Ọnụ na-ekwuchitere ndị uwe ojii n'Imo steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando kwuru na ha ejidela otu nwoke aha ya bụ Uchenna Egbuchulem onye obodo Ogwa ndị n'okpuru ọchịchị Mbaitolu maka ịdina nwa ya nwaanyị n'ike ma tụwa kwa ya ime. Ndị uweojii kwuru na nwoke a na-eji mma eyija nwa ya nwaanyị ma dịna ya n'ike. Akụko na-ekwu na nwunye nwoke a bụ onye Ivory Coast hapụrụ ya mgbe nwa ha dị obere. Dịka ọ dị ugbu a, ndị Uweojii sị na ha na-eme nyocha ha ma kwuo na ha ga-akpụpụ ya ụloikpe dịka iwu si di. Ndị INEC maka Covid-19 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Nigerian Independent Electoral Commission (Inec) sị ka ụlọọrụ ha dị na Edo nakwa Ondo mepee taa bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Mee. Gọọmentị nyere anyị ihe niile anyị ga-eji nọrọ n'ụlọ - Ndị Naịjirịa bi Amerịka Inec sị na nke a bụ maka ntuliaka na-abịa na steeti ndị a ahụ. Ha sịkwa ka sọsọ ndị ọrụ nwere ụgbọla malite ọrụ na steeti ndị ọzọ. N'Afrịka, Ụfọdụ ọdụm nọ n'ege a na-edowe ụmụ anụmanụ na mba Saụt Afrịka gbakpụrụ n'abalị foro chi Tuzdee. Ndị uweojii sị na-emechara nwụchịe ọdụm ndị a n'ehihe Tuzde mana ọ bụ ka ha kpagharịrịchara n'ime obodo Alldays ma yikwa ndị mmadụ egu.N'ofesi, Ngalaba ahụike mba ụwa bụ ""World Health Organization"" (WHO) ekwuola na ụfọdụ ọgwu a eji agwọ coronavirus na-enye aka site n'ime ka ọrịa ahụ naa ọsịsọ ma ọ bụ me ka etu o si egbu mmadụ dị mfe.WHO sị na ọ na-ele ọgwụ ise kachasị arụ ọrụ anya ọfụma. Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla" afirika-48278556,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48278556,"Solomon Dalung: Ọ gbala isi ekwere ịkwụ $130,000 IAAF kwụfere AFN?",Okwu Solomon Dalung kwuru gbasara ego otu IAAF kwufere Athletics Federation of Naịjirịa na-apịasa soshal midia ugbua.,"Ndị ntaakụkọ Premium Times depụtara ọtụtụ bụ ihe ha kwuru na o kwuru mgbe ọ bịara ọgbakọ egwuregwu ịgba ọsọ emere n'Edo steeti. Mana BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti, Dalung kwuru na ha ga-apụtarịrị n'okwu a maka mmekọrịta ha na ndị IAAF nwere. Mgbe onye ntaakụkọ anyị gwara ya kọwa akụkọ na-efegharị na soshal midia, Dalung gwara ya ya ga-ajụọ ndị depụtara ya okwu ekwuru na o kwuru. Anyị gakwara n'ihu jụọ ya maka etu ha ga-esi pụta n'okwu a dịka o si kwu, ọ pịṅụrụ ekwenti ya. Akụkọ pukwutere anyị n'ụtụtụ a gbasara ndị isioche ndị na-eme egwuregwu maka ego akwụnyere AFN bụ nke furu ọhịa kemgbe 2017 abụghị ihe na-enye ọṅụ. Minista na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa bụ solomon Dalung agbachila BBC Igbo kọrọ BBC Igbo mgbe anyị kọrọ ya ka ọzara ọnụ ya. Kayode Thomas bụ ọnụ na-ekwuru Minista ahụ n'ekwenti ịjụta ya maka ego IAAF na-ekwu na ha kwụfere NFA. Thomas kwetere n'ezie ""AFN ji IAAF ụgwọ ruru Puku dọla iri abụo"". N'ịta ha ahụhụ, IAAF bụ ngalaba na-achịkọta ndị na-eme egwuregwu na mbaụwa niile na-ekwu na ha ga-amachi AFN isonye n'egwuregwu ọbụla a na-eme maọbụrụ na ha akwụghachịghị ego akwụfere ha. Gịnị na-ese? Ndị bịara asọmpi n'Asaba n'afọ 2018 Mana mgbe ha na-akwụnye ya bụ ego n'ọba ego, ha kwunyere ego ruru dọla puku otu narị na iri ise ($150,000) nke pụtara na o ji ?($130,000) karịa ego ha kwesiri ịnweta. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a. IAAF vs AFN: 'Ka ego a si gaa mgbe m na-arụ na AFN'- Thomas Onye nyụrụ ihe na-esinu? Thomas kwuru na mgbe ihe a mere na Oga ya bụ Akawo Amaechi na-apụ n'oche dịka onyeisi AFN mana ọ gwara minista na-ahu maka egwuregwu na Naịjirịa bụ Solomon Dalung maka nkwụfe ego ahụ. N'okwu ya, ""mgbe onyeisi m gwachara Dalung maka ihe a, ọ sị ya weta ego ahụ. Amaechi wejere ya ego mana ọ maghị ihe oji ego ahụ wee mee."" Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnweta minista Dalung kpụrụ afọ n'ala. Ọnụ na-ekwuru ya bụ Nneka Anibeze gwara BBC Igbo na ya agaghị ekwụ ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu kama anyị kpọba minista na ọ bụ ya ma maka ego ahụ. Anyị gbakwara mbọ ịnụta n'ọnụ onye na-achị AFN ugbua ma ndị chiburu mbụ mana ekwentị ha nyụrụ anyụ. Gịnị ka nke a pụataara egwuregwu Naịjirịa? 'Ihe a ga-ebutere Naịjirịa ezigbo ule n'ihu maọbụrụ IAAF mezuo obi ha' -Koiki Tunde Kọiki bụ onye na-enyocha ihe na-eme n'egwueregwu kwuru na ọ bụrụ na IAAF mezuo nkwa ha ịmachị AFN, nsogbu ndị a ga-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46268758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46268758,Chike Ukaegbu: O nweghi ihe jịkọrọ ndị kara nka na ọdịnihu anyị,Chike Ukaegbu bụ nwa afọ Igbo a zụrụ na mba Amerịka.,"Ọ laghachiri Naịjirịa ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 n'okpuru otu ndọrọndọrọ AAP. Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, ọ kọwara na ọganihu Naijiria adịghị n'aka ndị karala nka n'ihi na ọ bụ ha dowere Naijiria n'ọnọdụ ọ nọ ugbua. N'ihe gbasara asụsụ Igbo, Ukaegbu tara ndị nne na nna ụta na ọ bụ ha mere na ụmụ ha amaghị asụ Igbo dịka o kwesịrị. Gee ya n'uju ebe a." afirika-43180155,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43180155,Ọgbaaghara APC: Oyegun asaala Tinubu,"Iji gọpụ na ebubo eboro ya, onyeisioche otu APC bụ John Odigie-Oyegun kwuru na ya kwụ Bola Ahmed Tinubu na-azụ na mbọ ọ na-agba idozi esemokwu dị na pati ha.","John Odigie-Oyegun na Tinubu na-enwebu esemokwu n'ime pati ha N' akwụkwọ ozi Tinubu degara Oyegun abalị ole na ọle gara aga, o kwuru na Oyegun na-etinye aka enwe n'ofe n'ihe gbasara ọrụ idozi esemokwu dị na pati ha nke onyeisiala Naijiria bụ Buhari nyere ya. Na ọsịsa ya, Oyegun kwuru na ya matara na ọrụ ahụ nke onyeisiala nyere Tinubu tara akpụ, ma kwe nkwa ị kwado ya. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị, ""Ka m kelee gị ọzọ maka ọrụ ịkpa udo nke onyeisiala nyere gi. ""Ọ bụ ọrụ tara nnukwu akpụ mana ekwenyere m na obisike nke onyeisiala nwere na gị mere ojiri nye gị ọrụ ahụ. Aga m enye gị ezi nkwado ịrụ ya."" Oyegun zigakwara akwụkwọ ozi ahụ Buhari, osote ya bụ Yemi Osibanjo, onyeisi Sineti, bụ Bukola Saraki, onyeisi ụlọomeiwu nke nta, Yakubu Dogara, bụ ndị Tinubu nyere akwụkwọ ozi o degara Oyegun. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43361965,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43361965,Gọọmenti Syria nọ n'ụzọ mmeri n'ọwụwa anyanwu Ghouta,Ndị agha Syria ekebiela ọwụwa anyanwu Ghouta bụ ebe ndị agha ndị na-ekweghịekwe na Syria nọ ụzọ atọ.,"Ndị agha Syria na-achọ ka ha merie ndi ekweghịekwe na-ebuso ha agha Ndị agha gbara obodo Douma, bụ obodo kachasi na Eastern Ghouta okirikiri ma kebie obodo ọzọ na mpaghara ahụ. Mwakpo ndị agha Syria mere n'ọwụwa anyanwu Ghouta kewara obodo ahụ ụzọ atọ ugbua. Gọọment Syria bidoro ibuso ndi ekweghiekwe n'ọwụwa anyanwu Ghouta agha n'ọnwa Febụwari nke afọ a. Mwakpo ha na eme dị ha mkpa maka na ha sị na ndị ekweghiekwe na Syria si ebe ahụ agbapụ ogbunigwe jee Damaskọs, bụ ebe nọ gọọmenti n'aka. Otu ndị na elebanye anya n'ihe na-eme na Syria bụ ndị a na-akpọ ""Syrian Observatory for Human Rights"" (SOHR) sị na ndi agha gọọment Syria jizi ihe ruru ọkara mpaghara ọwụwa anyanwu Ghouta kamgbe ha malitere mwakpo ebe ahụ. Ndị United Nations ekwuola na ha ekweteghị maka ogbunigwe gọọmenti Syria na-atụ ga ọwụwa anyanwu Ghouta, maka ha sị na ọ bụ ita ndị bi ebe ahu ahụhụ. A na-ebo ndị agha Syria ebubo na ha na egbu ndị nkiti na mwakpo ha na-eme, mana ha si na ihe he na-eme bu izọpụta mpaghara ahụ, bụ ebe fọrọ na ndị ekweghiekwe ji na Syria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42942356,https://www.bbc.com/igbo/42942356,A ga-egbochili ọgụ ndị ọrụ ụgbọ na ndị Fulanị na-achị ehi,Kọmishona na-ahu maka mgbasa ozi nke Kano steeti bụ Mahd Garba arachala Gọvanọ ya bụ Abdullahi Ganduje ọnụ n'oku ahụ ọ kpọro ndị Fulani na-achị ehi ha lọtawa na steeti ha.,"A na-ebo ndị Fulani na-achị ehi ebubo na ha egbuola ihe karịrị mmadụ otu nari n'izu atọ gara aga Kọmishọna a kwuru nke a mgbe ya na onye ntaakụkọ BBC kparitọtara ụka taa bụ afọ mgbụrụ mbọchị ise nke ọnwa Febuwarị. Gọvanọ Ganduje sịrị na ha nwere ala ga abata nde mmadụ bụ ndị na-achị ehi, ọkachasị ndị sị Taraba nakwa Benue steeti bụ tigbuo zọgbuo ka njọ. Ganduje bụ onye Fulani gwara ụmụnne ya ha lọtawa kama ha na ndị ọrụ ụgbọ ga na-egburikọta onye ha na steeti dị iche iche. Dịka BBC pidgin siri dee, o siri na Gọvanọ ahụ sịrị n'ala karịrị na ""Rogo, Gaya, Kura, Tudun Wada, Ungogo n'ebe ndị ọzọ gọọmentị hapụrụ ala maka nchekwa ụmụanụ na akụkụ"". Gọvanọ ahụ sịrị na ha nwere ihe niile ga-enyere ndị na-achị ehi aka ime ka ahụ sie ehi ha ike. Ọ sịkwa n'ala ya wapụtara ha ga-abata ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ahịa, ebe egwuruegwu n'ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ị kpata ego ma nyere ndụ aka. Ọ bụ tigbuo-zọgbuo dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị Fulani na-achị ihe karịrị afọ atọ bụtere oku a Gọvanọ a kpọrọ." afirika-50158923,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50158923,'Ọgwụ ọbara mgbalielu na-aka arụ ọrụ n'abalị' - Nchọpụta ọhụrụ,"Ndị ma nke ekwe na-akụ ekwuola na ị chọọ ka ọgwụ ọbara mgbalielu gị rụọrọ gị ọrụ ọfụma, ṅụọ ya tupu ị laba ụra abalị.","Dị ka akwụkwọ mgbasaozi European Heart si kwuo, ọ bụ obere ntuziaka nwereike ịzọ ndụ. Ha kwukwara na nchọpụta ọhụrụ a na-ekwu na ọgwụ a na-aka enye mgbochi maka obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ, ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya tupu ị laba ụra n'abalị kama ịṅụ ya n'ụtụtụ. Ndị ọkachamara kwuru sị na ọnọdụ ime ahụ anyị maọbụ etu ahụ anyị si eme n'ime awa 24 dị n'ime otu ụbọchị na-emetụta etu anyị si anabata ọgwụ. Wegharịa ọgwụ ka ya na ahụ gị na-arụkọ E nwere ihe mgbaama dị ugbua na-egosi na ọgwụ dị iche iche, gụnyere ọgwụ maka obi, nwereike ịrụ ọrụ ọfụma ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya n'otu mgbe n'ụbọchị. N'ime nchọpụta nke ugbua, e ji ihe ruru mmadụ puku 19 wee nwalee ọgwụ ọbara mgbalielu ahụ. Na nwale nke e mere ndị si mba Spen: Komkom e ji etinye ọgwụ na-enyere ndị mmadụ aka ịma mgbe ha ga-aṅụ ọgwụ na ọgwụ ole ha kwesịrị ịṅụ Ọbara mgbalielu kwesịrị ịgbada n'abalị, dịka anyị na-arahụ ụra ma na-ezu ike. Ndị ọkachamara sị na ọ bụrụ na ọ daghị n'abalị, na-arị elu oge ọbụla, mgbe ahụ ka ị nwereike ibanye na nsogbu obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ. Dịka nchọpụta ahụ si kọwaa, ịnwụ ọgwụ gị n'abalị ga-enye aka ibudata nrugharị ọbara gị n'abalị, maka ndị a chọtara ya bụ ọrịa nke Bekee kpọrọ Hypertension n'ahụ ha. Ndị nke ṅụrụ ọgwụ ha tupu ha alaba ụra, nrugharị ọbara ha n'abalị nakwa n'ime ụbọchị dị ọkara, ọ gbadakwa ọzọ n'abalị, ebe ndị nke ṅụrụ nke ha n'ụtụtụ adịghị etu ahụ. Ọkammụta Ramon Hermida nke mahadum Vigo bu nchọpụta a n'isi, sị na ndị dọkịta nwereike itule ya ma gwa ndị ha na-agwọ ọrịa maka ya, n'ihi na o nwere ike ịzọ ndụ ọtụtụ ndị mmadụ. Atụmatụ e ji agwọ ọbara mgbalielu ugbua enweghi oge e dere na ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-eji agwọ ya. Ndị dọkịta na-akacha agwa ọtụtụ ndị mmadụ ṅụọ ọgwụ n'ụtụtụ makana nkwenye na-ekwu na ọ na-akụda nrugharị ọbara n'ụtụtụ. ""Mpụtara nyocha a gosiri na ndị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu tupu ha alaba karịa ịṅụ ya mgbe ha tetara, na-enwe ike ijide nrugharị ọbara ha. Nke ka mkpa bụ na ọ ga-ebudata ohere ha inweta ọrịa obi nakwa nke ọbara nakwa ọnwụ."" O kwuru na ha ka kwesịrị ime nyocha ndị ọzọ si n'ọgbakọ ndị mmadụ si mpaghara ọzọ ịmata ma nchọpụta ha ọ ga-abara onye ọbụla nakwa ọgwụ ọbara mgbalielu dị iche iche. Gbaara ụdịrị omume a ọsọ makana o nwereike ịmetụta nrugharị ọbara gị: Vanessa Smith, nke si na British Heart Foundation, kwuru sị: ""N'agbanyeghị na nchọpụta a kwadoro ihe a chọpụtaburula n'ihe gbasara ọrịa a, a ka kwesịrị imekwu nyocha n'ebe ndị mmadụ si agbụrụ dị iche iche nọ, nakwa ndị na-arụ ọrụ ịgbanwe oge (shift), iji chọpụta ma n'eziokwu n'eziokwu ịnwụ ọgwụ nrugharị ọbara n'abalị ọ na-aka mma maka ahụike obi."" ""Ọ bụrụ na ị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu ugbua, ọ dị mkpa ịjụ dọkịta gị tupu ị gbanwee oge i ji aṅụ ya. Makana e nwereike inwe ihe kpatara dọkịta ji sị gị na-aṅụ ya n'ụtụtụ maọbụ n'abalị."" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe nwaanyi na-arụ ọrụ ma nọdụ n'ọmụgwọ na-agabiga" afirika-54442166,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54442166,Baldness: Ihe na-akpata isi nkwọcha nakwa ihe ị ga-eme banyere ya,"Eloka (nke a abụghị ezigbo aha ya) bụ nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na abụọ, mana ọ gbara ya gharịị na ọ malitela inwe isi nkwọcha.","Isi nkwọcha nwere ike ime ka obi daa ụfọdụ ndị ntorobịa mba Ihe a na-echu ya ụra oge niile, n'ihi na ndị enyị ya na-eji ya amanye ya njakịrị n'ụlọakwụkwọ maọbụ na nnọkọ ha ọbụla. O kwuru sị: ""Aghọtaghị m ụdị ihe a, gịnị kpatara ntutuisi m ji epewanye mpe? E che m na ọ bụ naanị ndị okenye na-enwe isi nkwọcha?"" Ndị ọkachamara kwuru na isi nkwọcha ụmụnwoke nwere ike ịmalite mgbe mmadụ ka na-etoputa, bụ nke bekee kpọrọ 'teenage years'. Ọ na-agba Eloka gharịị ihe kpatara o je enwe isi nkwọcha n'agbanyeghị na ọ ka bụ ntorobịa Ụdị isi nkwọcha a ka Bekee na-akpọ 'male-pattern baldness"". Mana ya bụ ihe na-abvụkarị ndị topụtarala mmadụ ka ọ na eme, ma na-akawanye njọ dịka afọ mmadụ na-agbali. Gịnị na-akpata isi nkwọcha? Ọ bụrụ na nna maọbụ papa nnukwu mmadụ nwere isi nkwọcha, ohere onye ahụ inwekwa isi nkwọcha buru ibu Dịka Dọkịta Francis Chika Ezegbe si gwa BBC na mkparịtaụka ekwentị, ihe nwere ike ịkpata isi nkwọcha abụghị otu ihe, mana nke kacha apụta ihe na-abụkarị ihe na-esi n'agbụrụ. Ezegbe na arụ ọrụ dịbịa bekee n'ụlọ ọgwụ dị na mba UK O kwuru sị: ""Ọ bụrụ na isi nkwọcha dị n'agbụrụ mmadụ; ya bụ na nna maọbụ papa nnukwu maọbụ nwanne mmadụ nwere isi ya, ohere dị na onye ahụ ga-enwekwa isi nkwọcha."" Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ikpata isi nkwọcha gụnyere: Ụfọdụ ka isi nkwọcha nke ha na-amalite n'ihu isi Mana ihe na-akacha akpata isi nkwọcha na ndị ntorobịa na-abụkarị site n'agbụrụ. Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwuola na ntutu ọbụla dị mmadụ n'isi nwere ogo ndụ ya, nke pụtara na dịka oge na-aga, ntutu ahụ ga-eru n'isi njedebe ndụ ya ma kwụsị itopụta Gịnị na-egbochi isi nkwọcha? Ọ dị ọtụtụ mmanụ nakwa ọgwụ dị n'ahịa iji gbochie ndapụ ntutu, mana ndị ọkacha mara kwuru na o nweghị nnyocha gosiri na ha na-arụ ọrụ O nweghi ihe e kwekọrịtara kpọmkwem nwere ike igbochi isi nkwọcha, ọ kachasị ọ bụrụ onye o si n'agbụrụ ya. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọgwụ a kpọrọ 'supplements' nakwa mmanụ dị icheiche juru ahịa ugbua, bụ nke ndị na-ere ha na-ekwu na ha nwere ike igbochi ndapụ ntutu ma mee ka ntutu na-etoli nke ọma. Mana dịka Dkt Ezegbe si kwuo, o nweghị nnyocha ọbụla gosiri na e nwere ọgwụ na-egbochi isi nkwọcha. ""Ọ bụ eziokwu na e nwere ude maọbụ mmanụ nwere ike ime ka ntutu tolie nke ọma, mana ọ na-ete aka - ihe dịka ọtụtụ ọnwa - tupu ha arụọ ọrụ,"" Ezegbe kwuru. Gịnị ka onye nwere isi nkwọcha ga-eme? Onye ejije Nollywood bụ IK Ogbonna nweburu isi nkwọcha, mana ọ na-etinye ntutu aka mere iji chọkwaa onwe ya mma ọzọ Dịka dkt Ezegbe si kwuo, ọ baghị uru mmadụ ịdọgbu onwe ya n'ihi ihe ọ ma na ọ ga-emerịrị. O kwuru sị: ""O doro anya na dịka afọ mmadụ na-agbalite, ụfọdụ ihe dị n'ahụ mmadụ agaghịkwa na-arụ ọrụ etu ha si arụbu. Nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji chegbuo onwe ya. ""Ọ dị mkpa ka mmadụ nwee ntụkwasị obi n'ime onwe ya nke Bekee kpọrọ 'self confidence'."" ""Isi nkwọcha abụghị ọrịa, ya mere ejikwala aka gị gbuo onwe gị."" Mana o kwukwara na mmadụ nwere ike ịga ụlọọgwụ ga tinye ntutu n'isi ya bụ nke a kpọrọ 'hair transplant'. E nwere ụlọọgwụ dị icheiche na mba ofesi ebe e nwere ike itinyere mmadụ ntutu n'isi ya nke Bekee kpọrọ 'hair transpalnt' ""Otu onye agbatobi m na UK ebe a kwụrụ puku paund atọ (£3000) maka ịga ụlọọgwụ na mba Turkey maka 'hair transplant',"" Ezegbe kwuru. Puku paụnd atọ karịrị otu nde naịra (N1 million) na Naịjirịa. Mana ọ bụrụ na ị chọọ ntutu aka mere, ha juru eju n'ahịa ugbu, ma nke nwoke ma nke nwaanyị. Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa na-etinyezi ya bụ ntutu aka mere. Ha gunyere ndị ejije Nollywood bụ IK Ogbonna na Charles Okocha, dịrị gawazie. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: M na-ahazibu egwu, mana ugbua mụ na ụmụ m na-emezi ụmụnwaanyị isi" afirika-47382683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47382683,Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka,Onye ụkọchukwu ama ama bụ Rev. Fr. Ejike Mbaka ekwuola na ya ga-eji izu ụka a niile na-eto chukwu ma na-enwe aṅụrị maka mmeri Buhari meriri Atiku.,"Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka Mbaka kwuru na ọ bụ maka mkparị Peter Obi na ndị otu ya kparịrị ya ka o jiri daa ya bụ ntuliaka. O kwuru nke a n'ụbọchị Febrụwarị 27, 2019, mgbe ọ na-eme ekpere kwa Wenezde ya bụ ""I no dey again"" n'obi Adoration n'Ụmụchigbo iji Nike Enugwu. Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịdị na-akọtọ ya n'ihi na amụma ọbụla o buru bụ nke mụọnsọ gwara ya kwuo. O siri na ya gabigara ọtụtụ nkwutọ na ihe ịkpawa obi kamgbe ya na Peter Obi nwere nsogbu na Bazaar n'afọ gara aga. Okwuru na ya gwara Peter Obi na Atiku na ha bụ ndị dara ada tupu o foo ha na anya. Ọgara n'ihu maa ọkwa na ndị mmadụ na chukwu amazịla aka n'ihi na ọ bụ Chukwu kpọrọ ya oku. Akụkọ ga-amasị gị:" media-48637933,https://www.bbc.com/igbo/media-48637933,Gender roles: Ọ bụ iwu na nwaanyị ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di?,"BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ụbochị Fraidee n'ihe omume ha nke a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ' nke isi okwu ya bụ, ""Ọ bụ iwu na nwanyị ga-ama ka e si esi nri tupu ọ lụọ di?""","Ndị tinyere ọnụ na mkparịtaụka BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraidee kwuru na ọ bughị iwu na nwaanyị ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di Na ya bụ mkparịtaụka, BBC Igbo kpọtara ụmụada Igbo abụọ, Uzoamaka Aniunoh, Chukwunaeme Obiejesi na Obioma Ogakwu, ka ha bia tinye ọnụ na ya bụ okwu. N'uche ya, Uzoamaka kwuru na ọdikwaghị oke mkpa na nwata nwanyị ga-amụta otu e si esi nri tupu ọ lụwa di, kama na isi nri bụ ọrụ dịịrị ma nwoke ma nwanyị. O kwuru na ọbụ oge gboo ka a na-asị na ọbụ ọrụ nwanyi isi nri n'ezinaụlọ mana ihe atụghariala ugbua. Uzoamaka kwuru na ""ụmụnwanyị ugbua na-esozi di ha akpata ego, ọtụtụ n'ime ha na-arụ ọrụ bekee maobụ na-azụ ahia nke mere na ha anaghị enwechazị ohere isi nri oge nile."" N'aka nke ọzọ, Obioma kwenyere na o kwesiri ekwesi na nwoke na nwanyị ga-amụta isi nri, mana ọbụ ọrụ nwanyị isiri ezinaụlọ ya nri, nke mere o ji di mkpa na nwanyi ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di, mana ọbụghị iwu. Obioma kwuru na ""Ọ bụrụ na nwanyị amachaghị esi nri, di ya akuziere ya. Ọbụrụkwanụ na ego di, ha achọta onye na-esiri ha nri, maọbụkwanụ ha na-azụ nri n'ahia."" Onye nke atọ sokwa tinye ọnụ n'okwu ahụ bu Chukwunaeme Obiejesi. Obiejesi kwuru na nwoke kwesịrị ịma ka e si esi nri, mana ọ ka mma, dịka omenala Igbo si di, na nwanyị ga-amuta isi nri tupu ọ baa be di. Ọtụtụ ndi ziteere BBC Igbo ozi n'akara Facebook kwukwara na o dị mkpa na nwanyi toruru ịlụ di kwesiri ịma ka e si esi nri nakwa ka e si eleta ezinaụlo anya." afirika-50279948,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50279948,Child Trafficking: Etu dị na nwunye zụtara ụmụaka abụọ si ma n'ọnya ndị uweojii,Aka ndị uweojii akparala di na nwunye a na-ebo ebubo ịzụ ụmụntakịrị nwoke abụọ.,"Onye kwuru nke a bụ Bala Elkana, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti. Elkana kwuru na aha di na nwunye a bụ Chukwunonso Blessing na Chukwunonso Happiness. Dịka Elkana si kwuo, aka kpaara Blessing na akụkụ ahịa dị n'Alaba mgbe ọ chọrọ ịkpọ ụmụaka abụọ ahụ banye ụgbọala na-aga Ọnịcha. Aha ụmụaka ahụ bụ Joshua James na Samuel Gbawune. Ha abụọ gbara afọ isii na afọ atọ n'otu n'otu. Child Trafficking: 'Mgbe a gwara m na m bụ nje HIV ekwetaghị m' Blessing kwuru na ọbụ di ya kutere ụmụaka abụọ ahụ n'ụlọ ụmụaka enweghị nne na nna nke dị na Jos, Platu steeti. Mana mgbe aka uwojii kpatara di ya bụ Happiness, ọ sara asịsa na ọ zụrụ ụmụaka ahụ azụ. Onye resiri ya ụmụaka ahụ bụ nwaanyị a na-akpọ Mama Oyoo n'ọnụ dị otu narị puku na puku iri anọ (N140,000). Elkana kwuru na ndị uweojii na-agbazị mbọ ịchọta ezinụlọ ụmụaka ahụ ka ha nyeghachi ha ụmụ ha. Mmepe 'border' agaghị abụ n'afọ a Naịjirịa agaghị emeghe oke ala ya na mba ndị gbara ya okirikiri ruo ọnwa Janụwarị nke afọ 2020. Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ nke a. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ 'Channels TV' si kwuo, akwụkwọ ozi kwupụtara nke a pụtara n'abalị mbụ nke ọnwa Novemba. Onye dere ya bụ Victor Dimka, onye jị ọkwa 'Comptroller (Enforcement)' na ngalaba 'Nigeria Customs Service'. Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Ọ kọwara na ihe e ji gbatịa oge a ga-emepe oke ala Naịjirịa bụ maka na ha chọpụtara na mmechi a e mechiri ya mịtara nnukwu mkpụrụ. Dimka gara n'ihu kwuo na ọ ka nwere ihe ha chọrọ ịnweta na ya bụ mmech 'border'. Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka Nke a na-abịa na-agbanyeghị akwa ndị mmadụ na-ebe maka oke ahụhụ nke kwuru na mmechi 'border' butere. Mana gọọmentị na-ekwu na mmechi oke ala ga-eme ka ndị mmadụ zụwa ihe ndị emepụtara na Naịjirịa nke ga-eme ka akụnụba gbalie. Akpachaghị anya, APC ga-akụ afọ n'ala n'afọ 2023 - Okorocha Rochas Okorocha bụ onye na-akwado si onyeisiala Naijiria bụvMuhammadu Buhari ike Sịnetọ na-achịteanya Imo West bụ Rochas Okorocha akatọọla ihe na-eme n'ime ụlọ pati ya bụ APC ma kwuo na nke a nwereike imegide ha na ntuliaka 2023. Rochas kwuru nke a na Kano n'ụbọchị Satọde n'ihi nsogbu dị n'etiti onyeisoche APC bụ Adams Oshiomole na gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki. O kwuru na Pati ọbụla na-ebuso onwe ya agha e tozughi ịbụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ọ ga-aghị akwụli chịm. Okorocha sị na APC agbahapụla usoro e jiri hiwe ya n'afọ 2015 nke nyere ikike ha ji na-apụ PDP ọchịchị na ntuliaka afọ ahụ. Rochas emerighị ntuliaka APC Imo West Na ọ bụ agwa nakwa ugwu onyeisiala Buhari wetara n'APC bụ ihe ha jiri malite mana ọ dị ka ""aka ịkụ ngwọ Sebasten agbanweela"". Na nke a nwereike inye ha nsogbu n'afọ 2023 dịka onyeisiala Buhari ga-arịtu n'ọkwa. N'okwu ya ""ọ bụrụ ma a kpachaghị anya, APC ga-esoro onyeisiala Buhari laa n'afọ 2023, ọ ga-abụ ihe ọjọọ nye ndị hiwere ya"". Okorocha gara n'ihu nye ndụmọdụ ka ndị APC were aka ahụ ha ji malite n'afọ 2015. Atụmatụ mgbochi ịbanye otu nzuzo 'Otu nzuzo napụrụ m akwụkwọ m tara ahụhụ wee banye' Ndị uweojii n'Enugwu state ga-akpaghari okirikiri Enugwu niile n'abalị asaa nke ọnwa Dịsemba iji dọọ ndị mmadụ tụmadị ndị na-eto eto aka na ntị ka ha zeere ịbanye otu ọjọọ. Ebere Amrizu bụ okwuru ọra ndị uweojii na steeti ahụ bụ kwupụtara nke a. Amarizu kwuru na mkpagharị a so n'atụmatụ a kpọrọ Police Campaign Against Cultism and Other Vices. Ndị na-akwado atụmatụ a gunyere Nkem Owoh, Patience Ozokwor na ndị ọzọ. N'akụkọ yiri ibe; Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Otu jikọtara ndị ọkaiwu bụ Nigerian Bar Association akpọọla oku ka a tọhapụ onye otu ha bụ ọkaikpe Chioma Iheme-Nwosu a tọrọ n'Edo Steeti n'izuụka gara aga. Onyeisi otu a bụ Paul Usoro gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ n'ihi nke a. Otu NBA etiela mkpu maka onye otu ha a tọọrọ SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria Onyeisioche pati APC bụ Adams Oshiomole ekwuola na ndị wakporo gọvanọ Obaseki nke Edo Steeti na ndị ọzọ n'ụlọ ya bụ ndị na-arụrụ osote gọvanọ Philip Shaibu ọrụ. Oshiomole kwuru nke a site n'ọnụ odeakwụkwọ ya bụ Simon Ebegbulem. N'ofesi Ụlọọrụ na-enye aka n'ịchọtara ndị mmadụ ụlọ a kpọrọ Airbnb amachiela ime oriri na nkwari n'ụlọ ha maka mwakpo e mere n'otu ụlọ ha na California nke gburu mmadụ ise. Onyeisi ụlọọrụ a bụ Brian Chesky depụtara nke a n'akara twitter ma kasie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ obi. Ngagharịiwe na Hong Kong E ji arụ tapụ Andrew Chiu Ka-yin ntị Otu nwoke ji mma merụọ mmadụ anọ ahụ ma were arụ tapụ onye ọzọ ntị oge a na-eme ngagharịiwe na mba Hong Kong. Ọ karịala ọnwa anọ ndị mmadụ malitere ngagharịiwe na mba Hong Kong n'ihi ọchịchị aka ike si n'aka ndị ọchịchị mba Chaịna. N'egwuregwu Leicester City meriri Crystal Palace 2-0 Otu egwuregwu bọọlụ Leicester City jị ọkpụ goolu abụọ asataghị otu nyụọ ndị Crystal Palace anya n'ehihie ụbọchị ụka n'asọmpi English Premier League. Nwaafọ Igbo bu Wilfred Ndidi so n'egwu mgbe ha nwetara mmeri a. Levante menyụrụ Barcelona anya n'asọmpi La Liga ụbọchị Satọdee site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie ha. Agbanyeghi na Barcelona bu ụzọ nye ha goolu, Levante ji nkeji asaa nye Barcelonia goolu atọ ndị ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" afirika-57289268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57289268,Biafra Sit-at-home: Anyị achọghị nkwafu ọbara ndị aka ha dị ọcha echi - Nnamdi Kanu,"Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) adụọla ndị otu ya ọdụ gbasara nọrọ n'ụlọ (sit-at-home) a ga-eme n'ụbọchị Mee 31, maka ncheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.","Kanu gwara ndị otu ya sị ""Achọghị m ihe ga-eme ka e nwee mwakpo ọbụla echi, m na-akatọ ya (mwakpo) kpam kpam. ""Anyị achọghị nkwafu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ya mere m ji asị ka onye ọbụla jide onwe ya aka, na-asịkwa ka ndị mmadụ kwanyere ndụ ihe karịrị mmadụ nde ise nwụrụ ka anyị wee dị ndụ ugwu"". Kanu kwuru nke a ka ọ na-ekpe ekpere Ncheta Biafra n'ụtụtụ Sọnde, kwukwara sị na ọ chọghị ka ahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ na ebe ndị ọzọ mepee n'Ala Igbo ma ncha n'ụbọchị Mọnde. O kwukwara sị ""Ị chọọ ịdị ndụ, apụtakwala echi n'ihi na ndị iro anyị nwereike igbado ụkwụ ebe ahụ wee bido ihe ha na onwe ha enweghi ike ịchịkwata. ""Anyị achọghị ka mmadụ nwụlahụ anyị ma echi ma taa, ya mere m ji arịọ onye ọbụla ka udo chịa dịka anyị na-echeta ndị nwụrụ n'ihi anyị."" Biafra Remembrance Countdown: Lee ka Enugwu na Umuahia dị taa Dịka taa bụ Mee 30 bụ ụbọchị ncheta agha Biafra, lee etu ụfọdụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị. N'agbanyeghi na ụfọdụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra kwechiri na ha ga-eme nọrọ n'ụlọ taa, ndị ọzọ dịka otu Ipob kwuru na ha ga-eme nke ha echi bụ Mee 31. Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị na-agara mkpa ha, ebe ndị ọzọ si taa bụ Sọnde nọrọ n'ụlọ na-echebiri ihe ụbọchị ga-eweta. N'Enugwu, Ụfọdụ ndị mmadụ na-agara mkpa ha, ụfọdụ si ụka na-alọta. Igboeze street indpendence Layout Enugu New haven junction, Enugwu Ụfọdụ ụzọ tọgbọ chakoo. Bisala Road, Indpendence Layout, Enugwu N'Umuahia nke Abia steeti, N'agbanyeghi na ọsọ gbara n'ụmụahịa dịka ndị omekome mụnyere 'State CID' ọkụ, ụfọdụ ndị mmadụ apụtakwala na-agagharị mkpa ha. Ahịa azụghị n'Owerri, Abakaliki nọ ka onweghi ihe na-eme n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee Ngwụcha izu a ka emume Ncheta Biafra (Mee 30) ga-adị. Ọtụtụ otu na-agba mbọ maka nwere onwe Biafra mapụtara etu ha ga-esi eme ya bụ emume. Otu Ipob higharịrị ụbọchị nke ha gaa ụbọchị Monde bụ Mee 31, ebe ndị ọzọ kwechiri na ọ bụ Mee 30 ka ha ga-emerụba ya bụ emume. BBC Igbo gagharịrị n'ụfọdụ ebe n'Ala Igbo ụbọchị Fraide were hụ na a nụwala isi anwụrụ etu emume ahụ ga-esi ga na ngwụcha izuụka a. Owere isiobodo Imo steeti na-apị mbazụ dịka naanị mmadụ ole na ole nọ n'ụzọ dịka ndị mmadụ na-akwado mmemme icheta ndị nwụrụ n'Agha Biafra ihe karịrị afọ 50 gara aga. Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị n'Owere ụbọchị Fraide, kwuru na ọtụtụ ndị ahịa apụtaghị n'ihi iwu nọrọ n'ụlọ nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere ndị otu ha. Ụlọakwụkwọ emepeghị n'ihi egwu ihe ntụmadị nwereike ịpụta maka iwu ahụ ipob tinyere.Ọtụtụ ọdọahịa dị n'okporoụzọ a ma ama n'Owere emepeghị. Ndị gwara onye ntaakụkọ BBC okwu sị na ọ kaara ha mma ịhapụ ebe ha na-achụ ihe afọ ga-eri karịa na ha danyere na nsogbu ha amaghị. Mana ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha zuru ka emee n'ichekwa steeti ahụ. Okigwe Road,Owere Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bala Elkana, gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ọrụ nchekwa ga-awa ndị Ipob ọbụla kpara aghara agba. Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Declan Emelumba, kwukwara na gọọmentị steeti ahụ na ndị ọrụ nchekwa ga-ejikọ aka ịhụ na otu Ipob ebuteghị ọgbaghara n'oge a. N'Ebonyi, ebe niile na-ekpo ọkụ ka ọ na-adị N' Ebonyi steeti, o nweghị ihe gosiri na ndị mmadụ dị njikere isonye n'iwu 'nọrọ n'ụlọ' Ipob tinyere maka ncheta Biafra dịka ndị mmadụ na-agara mkpa ha. N'Udensi Roundabout, ụgbọala na-agara onwe, ebe ndị nwere ọdọahịa nakwa ụlọọrụ mepere. Ndị ọrụ oyibo gakwara ọrụ. N'Ihitte Uboma Ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha. Odakwụkwọ ahotu ndị ahịa lmo Rescue Market, dị n' Obowo bụ Prince Ahamefule gwara BBC Igbo na ọ bụ iwu gọọmentị nyere ha ka ha ga-ege , na ọ bụghị otu Ipob. Ụbọchị Monde, a hụrụ ndị ji gara zụọ osikapa, agwa na iji n'ahịa ahụ n'ihi egwu dịka kepukepu kwuru na ahịa agaghị azụ maka mmachị 'nọrọ n'ụlọ'." afirika-45886197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45886197,"""Nwa m nwoke dị afọ 13 gburu nwa m nwaanyị""","Oge Charity Lee dị naanị afọ isii, nne ya gbagburu nna ya ebe ha bi na Texas mana amaghị ya ikpe ọnwụ.","Paris oge ọ dị afọ 10, na-aja eze ka ya na Ella nwanne ya nwaanyị dị afọ abụọ oge ahụ na-egwu egwuregwu Ka afọ ole na ole gachara, Charity mụtara nwa gburu nwanne ya. Nwa ya nwoke bụ Paris dị naanị afọ 13 oge o magburu nwanne ya nwaanyị bụ Ella dị afọ anọ. Nke a pụtara na Paris nọ n'ụlọ mkpọrọ kemgbe afọ 11 gara aga nwere ike ịtọ ebe ahụ ruo oge ọ ga-agbagote afọ 50 na ọma. Kedụ etu nne ga-esi ghọta na nwa ya bụ onye agwụ na-akpa? Nne onye gburu nwanne ya ọ kwesịrị ịka hụ ya n'anya? Charity tụrụla ime Paris oge ọ dị afọ 20, ka ọ nọ na mahadum. Ka afọ itoolu gafere, ọ mụrụ Ella. A mụrụ Paris n'Ọktoba 10 nke afọ 1993; ka ụbọchị 16 gachara oge Charity gbara afọ 20 N'olu Charity; ""ebe Paris bụ omenanwayọ, Ella bụ ọbataosu ọkachasị n'egwuregwu."" ""Paris dị ka ọ hụrụ Ella n'anya nke ukwu, ebe Ella n'onwe ya ejighi ya egwu egwu."" ""Paris na-anọkarị nwayọ, mana dịka ụmụaka ndị ọzọ, ọ na-enwe oge ọ na-enye nsogbu mana enweghi ihe ọbụla o mere kpatara ka elebara ya anya iche."" Paris ejighi nwanne ya nwaanyị egwu egwu Paris bidoro ilekọta nwanne ya nwaanyị oge ọ dị afọ 12, ka Charity laghachịrị n'ịṅụ ọgwụ ike; n'ime ọnwa isii. Charity mechara chịkọlata onwe ya ọnụ, laghachị n'ụlọakwụkwọ ma bido ịrụ ọrụ. Ụbọchị anọ nke Febụwarị 2007 Paris ụbọchị ncheta ọmụmụ nke afọ 13 ya. O ga-emecha magbuo nwanne ya nwaanyị n'ọnwa atọ na-abịa n'ihu Charity kwuru ""agaghị m atụ asị, izuụka ahụ tara akpụ,"" a kọrọ ọnụ. Tupu ọ gawa ọrụ ụbọchị ahụ, ime ụlọ ha dịka ihu agha, mana ọ bụghị mbụ nwokorobịa ga na-ewesara nne ya iwe. ""Ella abụghị onye na-ebe akwa ma m na-apụ apụ, mana ụbọchị ahụ o kwugidere 'nne makụọ m ọzọ, susuo m ọnụ ọzọ'. O kwuru ya ọtụtụ oge, mere na m agaghị ọrụ n'oge."" Charity makụkwara Paris tupu ọ gawa ọrụ, gwa ya ""ị ma na m hụrụ gị n'anya. Anyị agabigala nke ka nke a njọ, anyị ga-apụtakwa na nke a."" Ella, oge ọ dị afọ anọ Ka e mechara, ndị uweojii bịakutere Charity n'ụlọọrụ ya gwa ya na nwa ya anwụọla, na Paris gburu nwanne ya nwaanyị. Etu ihe si mee Paris gakwuru onye na-anodo ha gwa ya ka ọ lawa tupu nne ya alọta. Ka ọ lawara, Paris bara n'ọnụụlọ Ella, tie ya ihe, tọdo ya n'akpịrị ma sụọ ya mma ugboro 17. Ọ kpọrọ otu enyi ya n'ekwentị, kpaa nkata nkeji isii tupu ọ kpọọ ndị gbatagbata n'akara 911. Ha gwara ya etu ọ ga-esi kunye nwanne ya nwaanyị ume ndụ, ọ gwa ha na ọ na-anwa ike ya, mana e mechara chọpụta na ọ nwaghị ike ya ịzọ Ella ndụ. Charity na Paris oge ụwa dị mma. Ella sere photo a. Paris jụrụ Charity ""gịnị ka ị ga-eme ugbua"" ka ọ bịara ịhụ ya ebe ndị uweojii nwụchiri ya. Ka Charity jụrụ ya ihe kpatara ajụjụ a, o kwuru sị ""ị na-ekwukarị na onye ọbụla merụọ ụmụ gị ahụ, na ọ bụ naanị oge ahụ ka ị ga-egbu mmadụ - gịnị ka ị ga-eme ugbua?"" Charity sị na o jighi ụjọ jụọ ya, na ọ jụrụ ya ajụjụ a dịka ọ na-ama ya aka. ""Nke a bụ mbụ m na-ahụ ihe ọzọ n'ime Paris. A ma m na ọ nwere iwe, mana nke ahụ abụghị naanị iwe. Ọ bụ ọchịchịrị."" Ọ bụrụ na Paris eruola afọ 18 oge ọ kpara arụ a, a gaara ama ya ikpe ọnwụ Gịnị mere Paris ji gbuo Ella? Paris gwara ndị uweojii na ya na nwanne ya nọ n'ụra, o teta hụ na Ella abụrụla mmụọ ọjọọ nwuru ọkụ, ya mere o ji were mma chọọ ịmagbu mmụọ ọjọọ a. Nyocha e mere gosiri na ọ nọ na-enyocha etu ọ ga-esi gbuo nwanne ya nakwa nne ya n'elu ịntanetị. A tụrụ ya nga afọ 40 maka igbu Ella n'afọ 2007. Charity ka na-aga eleta ya n'ụlọ mkpọrọ makana n'olu ya, ""ọ kwụsịbeghị ịhụ nwa ya nwoke n'anya."" Oge Paris ruru afọ 15, ọ gwara Charity na ihe mere o ji hapụ igbu ya bụ ka ọ dị ndụ kpọnwụọ Charity mechara mụta nwa ọzọ na 2013; afọ isii Ella nwụchara. Paris dị afọ 25 ugbua ka nọ n'ụlọ mkpọrọ na Texas, ebe e nwere ike ịtọhapụ ya n'afọ 2047. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" 43876260,https://www.bbc.com/igbo/43876260,Mmadụ 10 anwụọla n'ezinaụlọ onyeomeiwu,"Mmadụ iri gunyere ụmụ atọ, nwụnarịrị onye ụlọomeiwu Zamfara bụ Saidu Yarkufoji n'ihe mberede okporoụzọ.","Ihe mberede okporoụzọ na-egbu puku kwuru puku mmadụ kwa afọ NAN kwuru na ihe mberede ahụ mere na okpororụzọ Sokoto-Gusau road ụbọchị ụka tara isi ụmụụmụ ya anọ, ụmụnne nwaanyị ise na onyeọkwọ ụgbọala ya. Ndị mmadụ na-egosi obi mwute ma na-ekpere ndị nwụrụ anwụ ekpere. Fatima Mohammed Abbas, ""Ka Allah gbaghara ha nabata mkpụrụobi ha"" End of Twitter post, 1 Nasiru Ahmed, bụ ọnụ na-ekwurụ ngalaba na-ahụ maka njem nke a kpọrọ FRSC gwara ụlọakụkọ News Agency of Nigeria na ihe mberede ahụ ụgbọala Volkswagen kụkọtara na gwongworo kụkọrọ isi. ""N'ime mmadụ iri nwụrụnụ n'ụgbọala bụ mmadụ iri na abụọ, itoolu bụ ụmụnwaanyị."" Ahmed, kwukwara na mmadụ abụọ ndị merụrụ na-anata nleta n'ụlọọgwụ,Yariman Bakura Special Hospital dị na Gusau. Ọ rịrịọ ndị na-akwọ ụgbọala ka ha gbara njem abalị na ịgba oke ọsọ ọsọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53458109,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53458109,Idumuje Ugboko: Etu ndị uweojii si wakpo Idumuje Ugboko ma tọrọ eze ha,Ndị uweojii wakporo obi eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko nke dị na Delta Steeti bụ Obi Chukwunomso Nwoko ma tọrọ ya n'elekere mbụ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị Satọde.,"Obi Chukwunonso Nwoko, eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko na Ned Nwoko Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ onye ọgaranya a ma ama bụ Ned Nwoko zitere ndị biara ije ahụ. Historical Building: Ihe dị omimi maka ụlọ aja ụpa na-enye ndị Idumuje Ugboko ndo Mazi Igwe Enuoyibo, otu n'ime ndị okenye obodo ahụ, kwuru na ọ bụ okwu gbasara ala mere e ji tọrọ eze ha. Mana Ned Nwoko gwara BBC Igbo na ihe niile ahụ bụ asịrị. Gịnị na-ese? Akụkọ kwuru na ọ bụ ala nke Ned Nwoko chọrọ iji rụọ Mahadum bụ ihe na-ese okwu Dịka Mazi Enuoyibo si kwuo, o ruola afọ atọ okwu ala bidoro isere ndị obodo ha na Ned Nwoko. Enuoyibo kwuru sị: ""Ned Nwoko nwere ala dị hekta iri atọ na atọ (33 hectares) n'Ugboko, bụ nke e nyere ya n'efu"". ""O kwuru na ya ga-arụ nnukwu ebe a na-azụ ụmụ anụmanụ ma na-emepụtakwa nri si n'ahụ ụmụanụmanụ."" ""Mana ọ bịakwara kwuo ka e nyekwuo ya ala ọzọ dị hekta iri itoolu na abụọ (92 hectares), n'agbanyeghi na ala nke o nweburu enwe ka fọrọ."" Enuoyibo kwuru na Ned Nwoko sị na ya chọrọ iji ala ahụ arụ mahadum, mana mgbe ndị obodo jụrụ inye ya ala ahụ, ọ malitere iwere ala ndị mmadụ n'ike. Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko Ọ jụrụ sị, ""Ọ bụrụ na otu onye nwee ala karịrị hekta otu narị na iri abụọ (120 hectares) n'otu obodo, olee nke ndị obodo ndị ọzọ ga-enwezi?"" Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Ned Nwoko, ọ zaghị ekwentị ya mana o mechara saghachi ozi anyị zigaara ya. O dere sị: ""Biko gbachipụ ndị asịrị nkịtị. Ị chọọ ịmata nke bụ eziokwu, kpọtụrụ onyeisi ndị uweojii n'Asaba."" Anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya ugboro ugboro mana ọ azaghị. Onovwakpoyeya asabeghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị. Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na okwu ala a dị n'etiti Ned Nwoko na ndị Idumuje Ugboko oteela ọ malitere. Ụfọdụ akụkọ kwuru na oge Eze ọdịnala chịburu Idumuje Ugboko bụ Obi Albert Nwoko dị ndụ, o binyere aka n'akwụkwọ inye Ned Nwoko ala ahụ ọ chọrọ iji rụọ Mahadum. Mana oge ọ nwụchara, nwa ya nwoke onye bụzi Eze ugbua, bụ Chukwunonso, kagburu nkwekọrịta nke nna ya na Ned nwere. Mana anyị amatachabeghi nke bụ eziokwu. Ebee ka Obi Chukwunomso nọ ugbua? Obi Chukwunonso Nwoko (IV), eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko Mazi Enuoyibo kwuru na OEze ha ka nọ n'aka ndị uweojii nke Delta Steeti. O kwuru na ha amabeghị ebubo ndị uweojii boro ya nke kpatara ha ji were etiti abali wakpo ya. Enuoyibo zitere onyonyo etu ndị uweojii si gbakaa ụzọ ma tụọ anwụrụ na-agba anya mmiri (tear gas) tupu ha akpụrụ Eze ha." afirika-50029970,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50029970,Lagos State: Ụlọ adagbuola mmadụ anọ na Legọs steeti,"Na Legọs, dịka mmiri na-ezo esepụaka kemgbe ụtụtụ, ụlọ atọ adaala nke abụọ n'ime ha mere na Ikorodu.","Ụlọ dagburu mmadụ na Magodo, Legọs Ụlọ dara na Magodo Legọs Onyeisi ndị Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) bụ ndị na-ahụ maka ọdịmma gburugburu na Steeti ahụ bụ Femi Osanyintolu sị na mmadụ anọ nwụnyụrụ anya na nke dara na Magodo. Onye ozi ndị LASEMA bụ Nosa Okunbo sị na otu ụlọ dị n'ugwu dakwasara ibe ya na Otun Araromi nke dị na Isheri Magodo taa bụ Satọde. Akụkọ ndị ọzọ sị na ọ bụ nne, ụmụ ya abụọ na nwanne ya nwaanyị ka ya bụ ụlọ dagburu. Nna ha bụ onye meruru ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọogwu ugbua. Ozi anyi nwetere kwụru na LASEMA emezuola ihe iwu kwuru maka ụlọ dara ada na ya bụ Steeti. Iwu ahụ nyere ikike ka LASEMA kpochapụ aja ụlọ ahụ ozugbo ma nwere ya bụ ala maka ịtinye ndị mmadụ n'ọdachi. Ụlọ dara na Ikporodu Nchọpụta ndị LASEMA mere maka ụlọ nke dara na Ikorodu gosiri na ya bụ ụlọ akawala nka bụ nke mere mmiri ozizo ahụ ji kwatuo ya. Ụlọ ọdịda abụghị ihe ọhụrụ na Legọs dịka o siri mee na mbido afọ a mgbe ụlọelụ ogogo atọ dagburu mmadụ dị iri abuọ nke gụnyere ụmụakwụkwọ na Ita-Faaji dị na Lagos Isand. Ndị Ụka katọliki pụtara ekpere okporo ụzọ Egburu ndị ụkọchukwu katọliki abụọ na Benue steeti na onwa Aprelu afọ a. Ị nụụla, ndị uweojii n'Enugwu steeti adọọla ndị nche obodo aka na ntị ka ha ghara ịji osisi ma ọ bụ akpaaja gbochie ụzọ ndị njem sị agafe. Ndị uweojii a na-ebo dị na-akpa ụdị agwa a ebubo ngarị. Ọnụ na-ekwụrụ ha na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu sị na ndị nche obodo enweghị ikike iji osisi ma ọ bụ ihe ọbụla dọchie ụzọ ndị mmadụ sị aga, ha sepụ aka enwe na ya bụ ofe. Nke a na-eme dịka ndị ụka katọliki Enugwu ji ekpere gagharịa maka udo na nchekwa nke Naịjirịa Oke mmiri ozizo achụpụla ndị mmadụ na Japan Mmiri ozizo na oke ifufe emebiela ihe na Japan Ka a na-ekwu nke na-eme na Naịjirịa, na Japan, agwala ihe ruru mmadụ nde asaa ha kwara ngwongwo ha gbaa ọsọ ndụ ha maka mmiri ozizo na oke ifufe. Ọ dịzị ka ụwa ana ga-imebi na Tokyo ebe ọkụ latriki nyụrụ, ụgbọ oloko kwụsịrị , ihe ruru otu puku ụgbọelu kwụsịri ọrụ kemgbe ya bụ oke mmiri na ifufe malitere. Asọmmpi enyi na enyi Super Eagles Dịka Naịjirịa na Brazil na-akwado asọmmpi enya na enyi echi na Singapore, Toost Ekong bụ onye nọgodu ọnọdụ onye ndụ ndị otu Super Eagles ekwuola na-egwu anaghị atụ ha bụ afọ ha jiri buru ụzọ. Ekong kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkprịtaụka taa sị na ọ bụrụ na ndị egwu bọọlụ Senegal ga-azọta isi ha n'aka Brazil, na ha ga-eme ike ha. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Bọjetị 2020 Onyeisiala Buhari na ndị Mịnịsta ya Nke na-akpọtụ taa bụ na onyeisiala Muhammadu Buhari amachiela njem mba ofesi maka ndị Mịnịsta niile na-agabeghị n'ihu ndị omeiwu kọwaara ha atụmatụ mkpata na mmefu ego ngalaba ha na-elekọta. Buhari kwuru na nke a ga-enyere ndị omeiwu aka imecha nyocha bọjetị 2020 n'oge iji mee ka ọ malite n'ọnwa Janụwarị kpọmkwem. Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi nke si n'ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti nke onye binyere aka na ya bụ Willie Bassey, onye nhazi mgbasa ozi n'ụlọọrụ ahụ. N'ofesi Kevin McAleenan bụ onyeisi ngalaba ọrụ nchekwa a kpọrọ Homeland Security na mba Amerịka agbaala arụkwaghị m. McAleenan bụ onye nke anọ na-arụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba ahụ kamgbe onyeisiala Donald Trump malitere ọchịchị. Na soshal midia 'Twitter', Trump toro McAleenan ma kwuo na ya ga-ahọpụta onyeisi ọzọ n'izuuka na-abịa abịa. Naanị ọnwa isii ka MacAleenan nọrọ dịka onyeisi 'Homeland Security' tupu ọ wụsa ọwa. O gwara ndị ntaakụkọ na ọ baghịrị ya uru ịbụ onyeisi n'ọnụ ebe onweghị ikeke ọbụla gbasara otu ya bụ ụlọọrụ sị aga. N'akụkọ ọzọ Pictures aboard the Sabiti - allegedly taken on Friday - were published by Iranian state TV Mba Iran na-ekwu na a tụrụ ogbunigwe abụọ n'ụgbọmmiri ha nke bu mmanụ agbidi n'osimiri mmeemmee. Ọbụ ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta Iran na mba ndị ọzọ kwuru nke a. Akụkọ kwuru na Iran na-ebo mba Saụdi Arebia ebubo ịtụ ya bụ ogbunigwe, mana Iran agọọla na ha eboghị ụdị ebubo ahụ. Etu ihe si gbata kwụrụ, amabeghị ndị maọbụ onye tụrụ ogbunigwe ndị ahụ. N'egwuregwu Eliud Kipchoge Eliud Kipchoge onye Kenya abụrụla onye mbụ gbachara ọsọ maratọn n'oge erughị awa abụọ. Nanị otu awa na nkeji iri ise na itoolu ka o were Kipchoge iji gbaa ọsọ ihe karịrị kilomita iri anọ na abụọ. Nke a bụ nke ugboro abụọ Kipchoge na-anwa ime ụdị ihe a. Oge ọ nwara nke mbụ bụ n'afọ 2017 na mba Italy. Ka ọ gbachara ọsọ ahụ, Kipchoge kwuru sị: ""Nke a egosila na onweghị ihe mmadụ apụghị imeli."" ""Ugbua m merela ya, a na m atụ anya na ndị ọzọ ga-emekwa ya n'oge na-adịghị anya."" Mkpu ọṅụ dawara n'elu n'ala na Nairobi isi obodo Kenya mgbe Kipchoge ritere nzere a. A kụ[ịala Ịngland Mba Chek Rịpọblik ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Ịngland N'egwuregwu, mba Check Repọblik akụpịala mba Ịngland n'asọmpi itozu oke maka Euro 2020 nke ha gbara n'abalị Fraịdee. Nke a bụ nke mbụ a na-emeri ndị otu bọọlụ Ịngland kamgbe a malitere ịsọ mpi a, mana ha nwere ike itozu ịga Euro 2020 mah merie Bulgaria ụbọchị Mọnde. N'asọmpị ndị ọzọ, Potụgal meriri ndị Luzembọg 3-0, Fransị gbara ndị Aisland 1-0 ebe Tọkị meriri Albenịa 1-0. Asọmpị onye ka mma Nwaada Nyekachi Douglas eturula ugo n'asọmpi nwanyị kacha maa mma na Naịjirịa. Douglas bụ onye nọchiri anya Riva Steeti na asọmpi ahụ. Ihe nrite ọ nwetara gụnyere ụgbọala ọhụrụ nakwa ịnọchite anya Naịjirịa n'asọmpị nwaanyị kacha maa mma n'ụwa nke a ga-eme na London. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47117509,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47117509,Nigeria Election 2019: Ihe mere nrụrịtụka BBC n'ọwụwa anyanwụ ji bụrụ ọpụrụiche,Nrụrịtaụka nke BBC Igbo hibere maka ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ na ntuliaka 2019 abịala na njedebe mana akụkọ sọ ya n'azụ bụ ihe aka kpụ n'ọnụ.,"Ka anyị tinye anya n'ọnụ na njem a, iji rụpụta ihe ụfọdụ ndị a. Anyị ga-ebido n'Imo, bụ ebe amalitere ije a. N'ọnwa Janụwarị, BBC Igbo dere n'akara Facebook ha na o chọrọ ka ndị mmadu họpụta ndị ha ga-achọ ka BBC kpọta na nrụrịtaụka ọ ga-eme n'Imo. Tupu e mechie atụmatụ a, ndị mmadụ dere aha Uche Nwosu, Hope Uzodimma, Emeka Ihedioha na Ifeanyi Ararume. BBC gbara mbọ nweta ndị a ma zigara ha ozi maka emume a. Ha niile kwere nkwa na ha ga-abịa nrụrịtaụka a ma, mana mgbe egwu ruru ọgbụgba, ọ bụ sọsọ Uche Nwosu bịara zaa aha nna ya. Nke ka njọ bụ onweghi onye n'ime ndị a gwara BBC na ha agaghị abịa. Ma ruo mgbe nrụrịtaụka na-aga n'ihu, ụfọdụ n'ime ha na-aza ekwentị asị na ha nọ n'ụzọ abịa. Ndị mmadụ kwuru ihe ha che maka ụdịrị agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchi kpara n'Imo. ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC BBC si Imo gawa Abịa ebe Alex Otti, Joseph Nkoro, Okezie Ikpeazu, Blessing Nwagba na Emeka Uwakolam bụ ndị kwenyere na ha ga-abịa ya bụ nrụrịtaụka. Mgbe oruru n'omume, Okezie Ikpeazu sepụrụ isi na ya bụ nrụrịtaụka, ọ sị na ya nwere ihe ya na Onyeisisala Muhammadu Buhari mgbe nrụrịtaụka ga na aga n'ihu. Nrụrịtaụka gara ọfụma ma bụrụkwa ezigbote ohere iji hụ etu ndọrịtaụka emere n'Igbo ji bụrụ ihe ekwesiri ị na-eme mgbe ọbụla. O gosikwara na asụsụ Igbo di ezigbote mkpa ikwalite. Lee etu ya bụ nrụrịtaụka si ga ebe a: BBC Igbo si Abia gawa Ebonyi, ebe Ogbonnaya Okorie na David Umahi bụ ndị pụtara ịdọrịtaụka. Onye nke APC na steeti ahụ bụ Sonni Ogbuoji gwara ndị BBC na ihe mere ya ejighi bịa nrụrịtaụka ahụ bụ makana ọ na atụ egwu na ajọ ihe nwereike ime ya ma ya bịa. Lee etu osi ga ebe a Ihe dị mkpa pụtara n'Ebonyi steeti. Maka nrụrịtaụka BBC n'Ebonyi Nrụrịtaụka nke BBC nke afọ a gara ọfụma ma bụrụkwa ihe ga-eme mgbe ntuliaka ọzọ ga-eme n'ala Igbo. Matakwa na oso n'ime nrụrịtaụka BBC mere na Naịjirịa maka ntuliaka nke 2019 - BBC Hausa, BBC Yoruba na BBC Pidgin mekwara nke ha. Ihe mere nke BBC Igbo ji dị oke mkpa bụ na o bu nke bụ mbu ụdịrị ihe a na-eme n'Igbo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-53171899,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53171899,"Kanayo O. Kanayo: Ihe ise ị maghị maka KOK, onye ghọrọ ọkaiwu ka ọ gbachara afọ 58",Aha onye ejije Nollywood a ma ama bụ Kanayo Onyekwere Kanayo(KOK) na-akpọtụ akpọtụ ebe nile dịka ọ abụrụla ọkaiwu ụlọikpe Naijiria ka ọ gbachara afọ iri ise na asatọ.,"KOK pụtara n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu Naijiria ebe a na-azụ ndị gụrụ 'Law' na mahadum tupu ha enwe ike ịpụtakli n'ụlọikpe Naijiria a kpọrọ 'Law School' na Bekee na nsonso a. N'ozi o wepụtara na soshal midia, Kanayo, onye obi bụ sọ pọlina pọlina kwuru "" Onye si na ọ dị mfe, ya gaa ụlọakwụkwọ Iwu' mee ọfụma n'ụle."" Onye bụdị KOK a na-ekwu? Kanayo, onye ejije aha ya na-ada ụda. Lee ihe ndị i kwesiri ị ma maka ọkpọka a: Kanayo O. Kanayo: Abụghị m onye ọgwụ ego 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo Dịka ndị mmadụ na-ajụ ma na-ekwu na ọ bụ ịgwọ ọgwụ ka e ji mara Kanayo O kanayo na ndị igbo nọ na Nollywood. Kanayo bidoro were sị ""Ihe anyị na-eme na Nollywood bụ ịnyomi ihe na-eme n'obodo ma na-egosi etu obodo dị"". Kanayo O. Kanayo: Ihe m jiri chọọ ịzọ ịga ụlọomeiwu O kwuru sị ""ị na anụ maka ndị mmadụ na-efu izuụka ọbụla, anọkata a chọwa ha achọwa ma asịkwa na-eji ha mee ọgwụ ego. Anyị na-eme ihe ejije iji gwa ndị mmadụ ka onye na-eme njem kpachapụ anya"". Kanayao rụtụrụ aka mgbe Ruben Agbati dere edemede maka ihe dị omimi n'Aso rock were sị "" Ihe anyị na-agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'ihe ejije anyị bụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe; kedu ihe onye bịara ị rụrụ obodo ọrụ ji ịgwọ ọgwụ eme?"". O kwukwara na ọtụtụ ndị Naijirịa na-eji ihe egwuregwu mmadụ kacha eme ọfụma n'ihe ejije aba onye ahụ aha. Maka kepukepu na ndị Igbo na-agwọ karị ọgwụ Kanayo kwuru sị na onye ọbụla sị na ndị igbo na-agwọkarị ọgwụ bụ onye iberibe. Ọ sịkwa na onye ahụ amaghị ebe mmiri bidoro mawa ya. Igbo bụ ndị na-agba mbọ, nanị ọgwụ ndị Igbo na-agwọ bụ ịgbasị mbọ ike. Kama o kwukwara na ya asịghị na-enweghị ndị na-agwọ ọgwụ n'ihi na e nwee ọkụ na ọchịchịrị ka a dị kwa. Kanayo kọwara sị "" Anyị anaghị eme ihe ejije ndị Igbo, anyị na-egosi ihe na-eme n'ụwa na-emetụịta mmadụ niile"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54202445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54202445,Precious Chikwendu: Onye ka nwunye Fani-Kayode,Akụkọ na-ewu ugbua bụ na Precious Chikwendu na di ya bụ Femi Fani-Kayode agbaala alụkwaghịm.,"Akụkọ a malitere iwu n'ụbọchị Tọọsde mgbe Precious dere ngụpụta akwụkwọ nsọ n'Instagram ya. Nke mere otu ngalaba mgbasaozi n'ịntanet bụ 'blog' ji dee sị na o kwuru na ọ sị na ya na di ya agbasaala. End of Instagram post, 1 Mana ọtụtụ ndị mmadụ maara Fani-Kayode amaghị onye bụ nwunye bụ Precious Chikwendu Fani-Kayode. Ihe i kwesịrị ị ma maka Preciuos Chikwendu. Na nzaghachị n'akụkọ ịgba alụkwaghịm ha, di ya bụ Fani-Kayode agbaala ụlọ mgbasaozi ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe maka imetọ aha ya. Nke BBC maara ugbua bụ na Precious na di Fani-Kayode apụtabeghi kwuo na ha agbaala alụkwaghịm. 'Ụdị mkparị Fani-Kayode nyere o nwebeghị onye nyere ya' Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48138028,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48138028,UK akwadola Naịjirịa n'ụzọ siri ike imegide ndị oyindụegwu,Jeremy Hunt bụ onye odeakwụkwọ na mmekọ mba Briten bịara njem nleta ndị agha Naịjirịa na mpaghara uwgu Naịjirịa.,"Ọ bịbịa ya gosiri na mba UK ka kwụsị Naịjirịa ike n'ọgụ megide otu ndị oyindụegwu gụnyere Boko Haram. N'ozi o ziri ndị agha na Maiduguri, Jeremy Hunt si ""ndị omekome a achụpụla ndị mmadụ na bee ha.."" ""Boko Haram na otu ndị ọzọ yiri ya bụ mmehie n'ihe anyị jiri biri nke mere na mba Briten ga na-enye Naịjirịa nkwado ịmegide ha"" ka o kwuru. Mba Briten enyela Naịjirịa ihe ruru £300m n'afọ ise ma zụkwaa ihe ruru ndị agha 30,000 maka agha ebusoro Boko Haram. Akwụkwọ njikọ aka nke onyeisiala mba abụọ a binyere aka na ya n'afọ 2018 ga-awulite ụsoro enyemaka nke Briten na-enye Naịjirịa. Na Katsina, Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Katsina steeti bụ Gambo Isah akwọpụla aka ya n'akụkọ na-efegharị na ọ nwụchiri ndị echere tọrọ ogo nwoke oney nche onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari Ọ kọwara na akụkọ ahụ nwereike ịpụta site na nghọtaghịe. Igbo nọ mba ndị ọzọ, E meela Ernest Ezeajụghị Mayor obodo Brent nke dị n'isiobodo mba Briten bụ London. Maazị Ezeajụghị nke kwagara mba Briten n'afọ 2004 ga a bụ onye isi ojii mbụ ga-anọ n'ọkwa Mayor ahụ. Na mba ofesi, Ụlọụka Katọlịk n'ala Sri Lanka akagbuola ekpere ụbọchị ụka nke bụ Mass na Bekee maka kepu kepu a nụrụ na a na-akwado ịgba ogbunigwe n'ebe ahụ ọzọ Cheta na ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka nwụrụ n'ụbọc hị Ista mgbe a gbara ogbunigwe n'ụka ahụ. N'egwuregwu, Ndị na-akwado ọgbọsọ a ma ama bụ Caster Semenya arịọla ya sị ya alala ezumike nka maka ikpe mkpesa ya akagburu ụnya ahụ. Nke a bịara dịka o weputara ụfọdụ ozi n'akara Twitter ya na-ekwu maka ị wụsa ngwa ọgụ. BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50349512,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50349512,"Apostolic Nuncio: Lee Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu na Thaddeus Okolo, ụkọchukwu Igbo abụọ bụ 'Papal Nuncio'",A na-ezitara ndị okpukpere ụka Katọlik na Naijiria ndị ndu si Vatican a kpọrọ 'Papal Nuncio'.,"Ọtụtụ n'ime ha na-abụkarị ndị ọcha mana ị ma na e nwere ụmụafọ Igbo nọ na nnukwu ọkwa na mbaụwa? Papal Nuncio maọbụ 'Apostolic Nuncio' bụ onye nnọchiteanya nke Bekee kpọrọ 'Ambassador' nke Rome na mba ndị ọzọ. Ndị a na-eme papal nuncio na-abụkarị ndị bishọp kajara akaja na nkuzi Katọlik. Ụmụ Naijiria atọ ma bụrụkwa ụmụafọ Igbo, bụ ndị na-anọchịte anya ọchịchị Rome na mba ụwa; Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu n'Antille, Achibishọp Thaddeus Okolo n'Ireland na Achịbishọp Brian Udaigwe n'Benin na Togo. Ihe ị maghị maka Achibishọp Fortunatus Nwachukwu Ihe ị maghị maka Archibishop Thaddaeus Okolo Ihe ị maghị maka Achịbishọp Brian Udaigwe(Benin na Togo) Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya." afirika-46011603,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46011603,Biafra: Onye bụ Mama Biafra?,Ndị uweojii nwụchịrị Mama Biafra ụbọchị Wenezde 24-10-18 maka na ha sị na ọ na ere akwụkwọ mgbasa ozi Ipob.,"Ha kpụgara ya ụlọikpe bụ ebe nyere ya aka mbee na ego dị na puku narị naira atọ. Ụmụnwaanyị Ipob: Buhari na-achọ nnukwu okwu Ikpe ya dị n'aka ọkaikpe Linda Ugboaja n'ụlọikpe ime obodo dị n'Umuahia. Mama Biafra gwara ụlọikpe n'ikpe adịghịrị ya. Onye bụ Mama Biafra? Ezigbo aha nwaanyị a bụ Felicia Ejezie. Ọ gbara afọ karịrị iri asaa. Mama Biafra bụ onye Eziata Okpoto Umuisiobu nke Bende dị na okpuru ọchịchị Bende n'Abia steeti. Mama Biafra nụrụ dị onye Anambra steeti na nwata mgbe a lụrụ agha Biafra na 1963. Felicia mụtara ụmụ anọ bụ ndị bi n'ala bekee nke dịọkpara ya bụ onye agha na mba Amerịka. Ọ rụbụrụ ọrụ na ""Nigeria Ports Authority"" bụ ebe ọ nọ laa ezumike nka rue ugbua. Gịnị mere eji akpọ ya Mama Biafra? Di Felicia bụ onye agha Naịjirịa manyere ya ka ọ lụwa ya mgbe ọ perempe a na-alụ agha Naịjirịa na Biafra. Ihe mere o jiri zawa mama Biafra bụ maka ihe ọ gabigara mgbe agha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45032445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45032445,Lee nwata nwoke ji ọkụ nkịtị achụsa Ọdụm n'ọhịa,"""A hụrụ m ọdụm n'anya, ahụbeghị m ihe mere agaghị m ahụ ha n'anya.""","Richard Turere bụ nwata oge ọ mụpụtara usoro ọ ga-eji zọpụta efi ya n'aka ọdụm ""Ọ bụrụ na o nweghị ihe na-egbu ehi nakwa na o nweghị ihe ga-eme ha, anyị na Ọdụm ga-ebi n'udo. Ụdị okwu a gbagwojuru anya maka na o si n'ọnụ onye na-echekwa ehi na mba Kenya. N'ihi na ọrụ ha bụ iji ihe ọbụla rutere ha aka were chekwa ehi ha. Mana otu nwata dị afọ 18 abụghị onye nchekwa nkịtị. Oge o ruru afọ 11, ọ mepụtara ọkụ nke Bekee kpọrọ 'solar light' na-achụsa ọdụm chọrọ ịtagbu ehi n'ime ụlọanụ. Oge ahụ ọdụm na-atagbu ehi ruru itoolu n'otu izuụka. A na-ere ehi otu puku dọla. Nne Richard bụ Veronica kwuru na ""Ọdụm na-atagbu ehi anyị oge ọbụla mana oge o mepụtara ọkụ a, anyị enweghịkwa nsogbu a ọzọ"" Ọdụm atagbuola ọtụtụ efi n'obodo ahụ O were ya ọtụtụ oge tupu o mepụta ọkụ a nke ọma. Oge o bidoro, o mepụtara osisi na-eyi anụmanụ egwu tupu ọ rụọ ụlọ ehi jiri ezigbo ojii nke bụ na ọdụm anaghị ahụ ime ụlọ a anya, mana ọdụm na-anụ isi ya bụ ehi. Mana otu abalị Richard jiri ọkụ agagharị, n'abalị ahụ o nweghị ọdụm ọbụla biara ịtagbụ ehi ya. Nkuzi emume a Richard kwuru na: ""Ọ bụ oge m na-akwasa ihe ka m mụtara maka igwe electrọniks"" Ọkụ a Richard mepụtara eruola aka ndị mmadụ 750 n'obodo ya. Richard na-edozi ọkụ dị iche iche oge ọbụla ""O nwere oge ha na-akpọ m ka m doziri ha ọkụ ha maka na ha amaghị ka ọ sị arụ ọrụ."" Richard na-ere ọkụ ya nari dọla 200. Ọkụ dị iche iche ruru 15 bụ ihe na-ekpute na ya. Ụlọakụ Ehi Obodo Richard dị n'etiti Nairobi National Park dị na Kitengela. Ọ bụ obere osimmiri kewara obodo ya na ebe a anụmanụ na-ebi. Abalị ọbụla anụmanụ dị iche iche na-agbafe ala ya, ọdụm na-esokwa ha. Ọkụ Richard mụpụtara eruola ala dị iche iche Otu ụkọchukwu aha ya bụ Calvin Tapaya kọwara na ""Ọdụm na-enye nnukwu nsogbu n'ebe a. Ọ dị ha mfe ịtagbu ehi n'abalị. Mana cheta na ehi bụ ụlọakụ anyị."" Na agbanyeghị na o nweghị ego ọbụla gọọmentị nyere ya, Richard were nkwenye na ọkụ na-akwadọ ọrụ nke ndị na-achịkọta anụmaanụ n'ala ahụ nke a kpọrọ 'Kenyan Wildlife Service' na Bekee. Otu kwuru na ọdụm ruru otu narị na-anwụ n'afọ ọbula, ugbua sọọsọ 1,700 nọrọ n'ọhịa ala ha. Mmegharị Ọ bụ ndị mmadụ na-egbu ọtụtụ ọdụm. N'afọ 2012, ha gburu ọdụm isi. Abụọ n'ime ha toro eto. Ha gburu ha maka ha batara otu obodo na Kitengela. Ọkụ Richard ga-echekwa ọdụm biri na mpaghara bee ya na kwa efi biri na obodo ya. Richard na-eji igwe electronic na-amụta ihe gbasara ọkụ N'afọ 2014, gọọmentị Kenya mepụtara iwu ga-enye ndị nsogbu mmadụ na anụmanụ metụtara nke ọjọọ ego iti aka n'obi. Mana ihe na-eme n'ezie bụ na ọ bụghị oge ọbụla ka ha na-agwụ ụgwọ a. Akụkọ BBC nke a kpọrọ BBC Innovators series na-amụpụta ohere idoziri ọtụtụ ihe. Mmụta maka akụkọ a n'ebe a BBC Innovators. Ọkụ a Richard mepụtara agbanweela ndụ ya - ọ ga-aga otu nnukwu ụlọakwụkwọ dị na Nairobi n'efu dịka onye nwe Alibaba bụ Jack Ma kpọrọla ya oku. Ha na-akpọ ya 'nwata ọkụ ọdụm n'ala dị iche iche dịka Argentina na India. Richard Turere chọrọ ka ewu ya dị ndụ Richard na-ekwusi ike na ọ dị n'aka gọọmentị ka ha kwado ndị na-emepụta ihe dịka ya n'ala Kenya. Onye tinyere aka n'akụkọ a bụ Sheila Kimani. Ọ bụ Bill na Melinda Gates Foundation mepụtara akụkọ a." afirika-45058142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45058142,Ụzọ ị ga-eji mee ụmụaka gị obi aṅụrị n'oge ezumike,Oge eruola ọzọ mgbe ndị ụmụakwụkwọ nwere oge ezumike pụrụiche maka na ọ dị ogologo.,"Ụfọdụ ndị nne na nna akwadola etu ha ga-esi kpọga ụmụ ha ụlọakwụkwọ nke a kpọrọ 'Summer Lesson' mana ọ bụghị ụmụaka niile ka nke a ga-amasị. Ọ bụrụ na ị sonyeghi na ndị ga-akpọga ụmụ ha 'Summer Lesson', lee ihe ndị i nwereike i mere ha. Kuziere ha etu e si egwu mmiri Igwu mmmiri bụ ụzọ ụmụ gị ga-eji megharịa ahụ ma mụta ị zọ onwe ha ma ha danye n'ime mmiri. Ọ ga-emekwa ha ka ike gwụ ha ọfụma ka ha nweike rahụ ụra ọfụma ma too ọfụma. Gbalia kpọga ha taa. Kuziere ha eserese nakwa nka na ụzụ ndị ọzọ Kuziere ha etu esi agba egwu Igbo kwenu! O nwere egwu karịrị egwu ogene? Mba! Anyị a ga-akụziri ụmụ anyị ya? Eeeeeee Kọrọ ha akụkọ oge gboo Ị ma ụbọchị mbụ atụrụ ogbunigwe n'ala Igbo? Ị ma aha nwoke mbụ si n'oru tọghapụ onwe ya? Ị nwere ike ị maata nke a ma kuzikwara ụmụ gị. Otu ụzọ ị ga-esi mee nke a bụ ị kpọrọ ha gaa n'ụlọ ngosi dị ịcheịche n'ala Igbo. Aka-ọrụ Kpọrọ ha gaa ebe ha ga-amụta ọrụ aka. Nke a ga-eme ha mụta aka ọrụ nwere ike ị nye ha nri n'ọdịnihu maọbụrụ na ha enwetaghị ọrụ na ngwụcha mahadụm. Otu Ọgbọ Na ngwụcha, ọ bụrụ na ị bụ onye omenala na-amasị nke ọma, oge ezumike ogologo a bụ mgbe i nwere ike iji tinye ha na mmanwụ maọbụ otu ọgbọ n'obodo unu. Nke a ga-eme ka ha nwee ezigbo amamihe, akọ na uche banyere omenala Igbo nakwa n'ebe o siri ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51410890,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51410890,Boko Haram: Ihe ndị mmadụ sara Buhari maka 'mmeri' Boko Haram,Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n'ụbọchị Tọzde na mmeri ọchịchị ya meriri Boko Haram ebutela Nịajirịa nsọpụrụ n'ụwa niile.,"Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri kọwa, o kwuru nke a n'ozi oziri n'ọgbọ Eagles Square nke dị n'Abuja. N'ọnụ onyeisiala ""Ị ga-ekweta na mmeri anyị nwetara enyeghachila anyị nsọpụrụ na ugwu n'ụwa niile"". Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ jiri okwu ya maa njakịrị n'elu soshal midia. Onye dịka Ephraim Jidauna sị ya kedụ ebe mmeri ahụ dị n'ihi na ụjọ ka jide ọtụtụ mmadụ ugbua karịa na mbụ. King Davies kwuru na ndị na-adụ ya ndụmọdụ bụ ndị iro Naịjirịa n'ihi na onyeisiala Buhari amaghị ihe na-akpọtụ n'obodo. Teesleek na-ajụ ma Onyeisiala ebikwa na Naịjirịa chaa chaa? Roun kwenyere n'okwu ha na-ekwu na Buhari amaghị etu ihe si kwụrụ ya mere o ji aṅụrịrị maka mmeri ya Nchọpụta nke Premium Times mere gosiri na ihe karịrị mmadụ narị abụọ nwụrụ n'ihi okwu nchekwa sọsọ na Jenụwarị afọ a. Cheta na ndị ụlọomeiwu kpọkwara oku ka onyeisiala gbanwee ndị ọchịagha dị icheiche mana o gebeghi ntị n'okwu a." afirika-50707934,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50707934,Corruption in Nigeria: Kedu steeti akacha eri aka azụ na Naịjirịa?,Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ bụ National Bureau of Statistics ewepụtala mpụtara nnyocha ha mere iji chọpụta ebe mpụ na nrụrụaka ka njọ na gọọmentị.,"Aka chịburu steeti Imo bụ Rochas Okorocha na gọvanọ Imo ugbua bụ Emeka Ihedioha Nnyocha ha gosiri na ọ bụ n'Imo Steeti ka nrụrụaka na iri aka zụ kacha dị nta na Naịjirịa niile. Ndị NBS wepụtara mpụtara nnyocha a n'ụbọchị Fraịdee. Onyeisi ngalaba ahụ bụ Yemi Kale binyere aka n'akwụkwọ mpụtara nnyocha ahụ. Nke mbụ e mere ya bụ nnyocha bụ na 2016. Steeti kacha eri aka azụ A bịa n'iri aka azụ na Naịjirịa, Imo Steeti nwere pasenti iri na asaa na ụma isii. Bido n'afọ 2016 ruo ugbua, nnyocha ndị NBS gosiri na iri aka azụ na nrụrụaka kacha nta na steeti Imo Steeti ndị ọzọ iri aka azụ dị nta gunyere Jigawa, Kano na Plateau. Mana iri aka azụ bawanyere na steeti ndị dịka Akwa Ibom, Enugwu, Ebọnyị, Gombe, Kogi, Kwara, Osun na Niger. A bịa na mpaghara isii e nwere na Naịjirịa, ọbụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ka iri aka azụ kacha nta, dịka nnyocha ndị NBS si gosi. Ebe ọ kacha njọ bụ na 'North West', ebe 'North East' na 'South South' na esochi. Kedu ndị ka eri aka azụ? Nnyocha ahụ gosiri na ọbụ na ngalaba ndị uweojii ka mpụ, nrụrụaka na iri aka azụ kacha njọ. Ndị na-esote ha bụ ndị ọrụ ngalaba na-ahụ maka ala. Ndị ọrụ ụtụisi gbara ndị nke atọ na ndị kacha etinye aka na nrụrụaka nakwa aka azụ. Iri aka azụ gbadatara na Naịjirịa karịa ka ọ dị na mbụ. Mana dịka nnyocha ahụ si dị, iri aka azụ na-ebelata na Naịjiria karịa ka ọ dị n'afọ 2016. Na 2016, iri aka azụ na Naịjirịa dị pasentị iri atọ na abụọ na ụma atọ (32.3%). Mana na 2019, ọ gbadatara ruo pasentị iri atọ na ụma abụọ (30.2%). Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Cultural display: Lee ka esi mee mmemme Olu na Delta steeti" afirika-49963289,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49963289,Asuu Faction: Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha,Otu ọhụrụ a kpọrọ 'Congress of University Academics' maọbụ CONUA n'aha ịchafụ esila na otu ndị nkuzi mahadum bụ 'Academic Staff Union of Universities' kewapụ onwe ha.,"Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi na onye ọzọ. Otu a kwuru na iwe ha bụ nkụsasị nke Asuu na-akụsasị usoro oge agụmakwụkwọ na Naịjirịa n'ihi oke ịgba arụkwaghịm. Onye isi otu a bụ Niyi Sumonu gwara BBC na ha na-agba mbọ ugbua idebanye aha otu ọhụrụ ha ka o wee tozuo etozu na Naịjirịa. Dika Sumonu si kwuo ihe kpatara ha ji kewapụ bụ: 1) Iji mee ka e nwee otu ọzọ ga akwudoro ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi na mahadum. 2) Iji weta ụzọ ọzọ e nwere ike isi mezie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị nkuzi. Sumonu kwuru na ọdịghị mma etu Asuu na-esi agba arụkwaghịm maka obere okwu ọbụla dapụtara n'etiti ha na gọọmentị. Gịnị bụ 'Manage' n'asụsụ Igbọ? O kwuru na nke a na-ebute nghasa n'usoro agụmakwụkwọ na Naịjiria. Na nzuko izizi nke Conua nwere n'ụbọchị Satọdee, ndị biara nzukọ ahụ bụ ndị nkuzi Obafemi Awolowo University Ile-Ife; Federal University, Lokoja, Kogi State na Kwara State University. Ndị ọzọ bụ ndị Ambrose Ali University Expoma, Edo State nakwa Federal University, Oye-Ekiti. 'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwkwọ isi dara iwu' Mana Sumonu kwuru na ọtụtụ ndị nkuzi si ụlọakwụkwọ ndị ọzọ egosila mmasị isonye n'otu ọhụrụ ha. Akụkọ kwuru na onyeisi Asuu bụ Biodun Ogumyemi sị na ya amaghị maka ndị otu ahụ kewapụrụ ohụrụ. Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'igwe, ọ rịọrọ ka e zitere ya ozi 'SMS' n'ihi na ọ nọ na-nzukọ. Mana ọ zghachibeghị ozi anyi zigaara ya ruo mgbe anyị wepụrụ akụkọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọka mmụta Boniface Igbenehue" afirika-54445868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54445868,Onitsha Port: Usoro ị ga-eji esi osimiri Onitsha ebubata ibu,"Dịka onyeisi ngalaba National Inland Waterways Authority bụ George Moghalu kwuru na Onitsha adịla njikere ibubata ibu site na mmiri Onịcha, ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedu ihe ọ ga-ewe ha ibubata ibu site na mmiri Ọnịcha.","Onitsha Port: Uru mmepe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha ga-abara gị N'agbanyeghị na ọ bụ n'afọ 2021 ka ọdọụgbọmmiri a ga-ebido rụwa ọrụ, Moghalu kwuru na ha chọrọ ka o bido ọrụ tupu oge ha kwere na nkwa eruo. Moghalu kwuru na ha esila ọdọ mmiri Onne dị na Rivas steeti buru ibu bata Onitsha ma burukwa ya laghachị Onne iji tulee ọdọụgbọmmiri Onitsha; ma ihe niile gara nke ọma. Austin Okwaeze Nwosu bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke ndị Association of Nigerian Licensed Customs Agent akọwala ihe o nwereike ifu onye chọrọ ibubata ibu site na mmiri Onịcha. O ji ịtụbata ahụ ụgbọala nke bụ spare parts na bekee were maa atụ, Lee usoro ya ebe a : 1) Onye ahụ ga-aga ụlọakụ ya mepee 'Form M'. 2) Ọ bụ Form M a ka ọ ga-eji zụta ahịa Ịtụbata ụmụ mpịampịa ihe na Naijiria na-akụda Naira - Udofia 3) Ọ bụ form M a, Invoice na ihe ndị ọzo o jiri zụo ahịa ka a ga-eji mepee PAR 4) PAR bụ ""Pre Assesment Release"" bụ akwụkwọ na-egosi ahịa ole ọ zụrụ. 5) Akwụkwọ PAR a, ngalaba ndị gụnyere Customs,Mịnịstrị nke ego, SON, ndị Federal Inland Revenue dgz 6) Ị ga-enye onye ga-agbapụta ibu gị PAR na Bill of Lading nke ndi ebe ịzụru ahịa nyere gị. 7) Onye na-agbapụta ahịa ga-eji Bill of lAding wepụta ya n'aka ụgbọ bu ibu ma were PAR gwụọ ụgwọ nke ndị ngalaba Customs. 8) Mgbe ibu rutere ọdọ ụgbo mmiri dịka nke Onne, ị ga-akwụ Shipping charges, kwụo Terminal Charges. 9) onye ahụ ga-akwụ ụgwọ ụgbo mmiri a na-akpo Barge ga-ebubata ibu ya n'Onicha. 10) Mana onye ahụ nwereike ịkwụ ụgwọ Customs n'Onne maọbụ na nke Ọnịcha 11) O kwukwara na ndị nchekwa nke Customs ga-eso ya bụ ụgbo mmiri barge were gawa Onịcha. Ego ole ka ọ ga-eri? Dịka ego eji ebubata ihe dị iche iche, Nwosu kwuru na ego eji ebite ụgbọ mmiri Barge di ndala ọnụ. Ọ mara tụ na isi na ọdọ mmiri nke dị na Apapa Legos buru kọntena buga ọdo ụgbo mmiri nke dị na kirikiri legọs ruruNaira narị puku abụo na iri ise. O kwuru na o ga-adị mkpa ka etinye anya n'ụgwọ ndị barge na-ana. Kedụ uru ndị mmadụ ga-erite n'ọdọụgbọmmiri Ọnịcha? Moghalu rụtụrụ aka n'ụfọdụ uru ọdọgbụmmiri a ga-aba nke gụnyere; Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'Ọịcha kọwara etu ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a ga-esi baara ha uru. Silas Odo bụ onye na-azụ ahịa akwa n'Ọnịcha kwuru na ya bụ ọdọụgbọmmiri ga-eme ka ibubata ahịa dịrị ha mfe. Ọ sị na ka na-anụ ya dịka akụkọ na ọ bu mgbe o bidoro ịrụ ọrụ ka ha ga-ekwete. Kedụ ebe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a dị kpọmkwem? Ọdọụgbọmmiri a dị n'ebe a na-akpọ 'Ọgbọ osisi' dị n'Ọnịcha, Anambra Steetị n'akụkụ Akwammiri Naịja, Onye na-achịkọta Onitsha River Port bụ Baba Spencer kwuru na ihe niile ọdọụgbọmmiri Onitsha ga-eji rụo ọrụ zuru ezu. O kwuru sị ""mgbe ọdọụgbọmmiri a bidoro ọrụ, ọ ga-ebelata ego e ji ebubata ibu na ndị mmadụ site n'Onitsha gawa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa"". O kwuru sị ""ọ bụ n'afọ 1983 mgbe Shehu Shagari nọ n'ọchịchị ka a rụrụ ọdọụgbomiri a, mana a hapụrụ ya ruo mgbe Goodluck Jonathan kpalitere nruzi ya site n'afọ 2012"". Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo" afirika-52600478,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52600478,"Jim Iyke ekwuola eziokwu niile dị ya n'ọnụ maka ndị Igbo, ejije na ndụ ya",Onye ama ama na-eme ejije na Nollywood bụ Jim Iyke ekwuola hoha na nsogbu ndị Igbo nwere bụ ajọ ọchịchị.,"O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee 2020. Gbasara ihe o chere maka Biafra, o kwuru na ihe e ji achọrọ ya bụ atụmaatụ dị mma mana ọ bụghị ihe ga-egbo nsogbu ndị Igbo. Ọ jụrụ ma a chọta ya, ndị bu ya n'isi a ga-emeli ihe dị n'ịchị ndị Igbo? O kwuru na ndị Igbo jikọta aka ọnụ kwado onye nke nọ n'ọchịchị dịka agbụrụ ndị ọzọ si eme, a ga-enweta ezigbo ọganihu n'ala Igbo. Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Gere mkparịtaụka a n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44708885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44708885,Emmanuel Macron: Ịkwụsị ụmụ Afrịka ịgbaga Yurope dị n'aka ndị ndu mba Afrịka,Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na atụmatụ European Union ịrụ ụlọọrụ maka ndị mbịarambịara na mba Nọt Afrịka agaghị aba uru ma ọ bụrụ na mba ndị ọ metụtara ebughị ya n'isi.,"Buahari na Macron n'Asọ Rọk Macron onye kwuru nke a oge ọ bịara njem na Legọs sị na Fransị dị njikere ịkwadọ mba nọ n'Afrịka n'ihe gbasara nchekwa na okwu ndị mbịarambiara si Afrịka mana ọ kwụsiri ike na igbo nsogbu ndị a ga-esi n'Afrịka. Macron kwetara na Yurope ga-atọ n'igbo nsogbu ụmụ Afrịka ịgbata Yurop ọtụtụ afọ ma kwuo na ọ dị mkpa ka mba ndị Afrịka jịkọọ ọnụ chọta ogbugbo nsogbu ụmụafọ ha na-anwụfu n'oke osimiri. Ọ sịrị, "" Ọ gaghị enwe isi ma ọ bụrụ na ndị gọọmentị Afrịka ejikọghị ọnụ. Ọ na-adịkarị mfe, ikpebiri ndị ọzọ. N'ọgbakọ EU, anyị kwesịrị ibu ụzọ kwuoro onwe anyị. "" Dịka o siri gbasa mbịarambiara, ọ bụghị ihe kachasị mkpa ka ndị mmadụ gwuo mmiri asaa gaa mba asaa iji banye Yurop. Nke a bụ ihe m jiri kwenye na mkpa ọ dị ka anyị na obodo dị n' agbata oke osimiri Mediterranean."" O kwuru na Yurop ga-echesi oke ala ha na mba dị ọzọ ike ma nye aka ịhụ na nsogbu ndị si Libya na-ezuba ndị mbiarambiara si Afrịka site n'oke osimiri Mediterranean kwụsịrị. O kwuru na nsogbu ụmụ Afrịka ịgbaga Yurop bụ nsogbu oke ọmụmụ nwa n'Afrịka. Nke a abụghị mbụ Macron na-ekwu ụdị okwu a nke buterela ya nkatọ n'aka ndị sị na ọ na-ekwu dịka ndị ọcha chiburu mba Afrịka mana okwu ya gbadoro ụkwụ na ịkwanyere Naijria and mba ndị Afrịka ndị ọzọ ugwu dịka mba nwere onwe ya. Emmanuel Macron Bịara njem nleta na Nịajirịa ""Ihe anyị chọrọ ime bụ inye aka ma tinye onwe anyị mpaghara Afịrịka na Sahel nye aka luso ndị oyi egwu ọgụ ọkachasị na Mali na mpaghara ahụ. ""Anyị ga-anọ oge niile ndị ọyi anyị rịrọrọ anyị, ọkachasị na Mali.''Uche Akolisa ""Mana ihe dị mkpa bụ etu gọọmenti dị icheiche na mpaghara Afịrịka si ejikọ onwe ha ịluso ndị oyi egwu ọgụ ma chụpụ ọtụtụ ndị a ọkachasị ndị jihad. Ya mere m ji akwado atụmatụ G5 nke mpaghara Sahel ma na-eche ijikọ aka ọnụ. Naịjirịa, Nije, Chad na Kamerun dị mkpa."" Macron kwuru na ọ dị mkpa ka mba dị icheiche tinye uchu ịchụpụ ndị Jihad. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49276186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49276186,August Meeting: Nzụkọ Ọgọstụ Ụmụ nwaanyị n'ala Igbo amalitela ugbua,"Ụmụ nwaanyị Abatete, Anambra Steeti pụtara n'igwe iji mee mmemme nzụkọ ọgọstụ nke afọ a.","Ndị Nne Abatete Isi okwu ha na nke 2019 bụ Ịkwado ụmụ nwaanyị maka nlekọta ezinaụlọ ha. Onye isi ndị nne nke Odida Abatete bụ Ezinne Bridget Onwuka kwuru na ọ bụ ụmụ nwaanyị ji ụka nakwa ezinaụlọ ha. Ọ rịọrọ ndị nne niile ka ha were oke ọrụ a Chineke tinyere ha n'aka kpọrọ ihe. Oriakụ onwụka kọwara na ọ bụ ego ha na-atụkọta kwa afọ na nzụkọ Ọgọstụ ka ha jiri rụọ ụlọ fada nakwa ụlọ nzụkọ na-aga n'ihu n'Ụlọụka St Joseph Katọlik parish Odida Abatete, Abambra Steeti. Onye isi ndị nne Abatete na Legọs bụ Oriakụ Jerome Odekpo kwuru na ozi ya nwere na nzụkọ Ọgọstụ 2019 bụ ka ndị nne kuziere ụmụ ha ndị nwaanyị na mmekọ nwoke na nwaanyị n'alụghị di na nwunye abụghị ihunanya kama ọ bụ mmetọ anụ ahụ. Ihe ndị nne a si ọtụtụ mba bịa gbakọta n'Odida Abatete mere gụịnyere ịgba egwu, nkuzi, ịmụ isi nri, imụ ime ncha, ịchụ nta ego nakwa ihe ndị ọzọ. Nzụkọ Ọgọstụ na-aga n'ihu n'obodo niile dị n'ala Igbo ganye na ọnwa agafee. Ndị Nne Ọdịda Abatete na nzụkọ Ọgọstụ 2019 Ndị Nne Abatete Ndị Nne Abatete Ndị Nne Abatete Oriaku Jerome Odekpo, Onye isi ndị Nne Odida Abatete ngalaba Legọsụ Ndị Nne Abatete Ezinne Bridget Onwuka, onyeisi ndị Nne St Joseph Ọdịda Abatete Kirie ihe nkiri a: Kirie egwu ndị nne gbara n'ụkanne" afirika-43399892,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43399892,Ndị Aba ebidola ịrụ akpati ntuliaka nke Inec,"A mara obodo Aba kamgbe dịka ebe a na-arụpụta ọtụtụ ihe dị icheiche, mana oge na-adịghị anya ha malitere ị rụpụta igbe ntuliaka ndị Inec.","Independent National Electoral Commission (INEC) bụ ụlọọrụ na-ahazị ntụliaka na Naịjirịa Mgbe ndị ntaakụkọ gbara onye Gọvanọ ahụ Steeti bụ Okezie Ikpeazu ajụjụọnụ, O kwuru na nke a bụ iji kwalite ngwa ahịa ndị emere n'Aba. O kwuru na igbe ndị ejiri mee ụfọdụ ntụliaka na Naịjirịa bụ ndị Aba rụrụ ya. O kwukwara na ndị Inec tụrụ ahịa ka-arụpụtara ha igbe ndị ahụ karịa ị ga mba China tụbata ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mgbe ndị BBC Igbo gbara onye Kọmishịọna na-ahụ maka Mgbasa ozi na Steeti ahụ bụ John Okeiyi ajụjụọnụ. O kwuru na ha na-atụ anya ka ndị Inec bịa tụọ ahịa maka igbe a ga-eji mee ntụliaka nke afọ 2019. Ihe ọzọ ndị Aba na-arụ: Ndị Aba ebidola ịrụ akpaụkwụ ndị agha Naịjirịa kamgbe ọtụtụ afọ gara aga. Okeiyi rụtụrụ aka na oge gara ndị agha Naịjirịa bịara Aba zụọ akpaụkwụ ndị agha ruru puku iri ise (50,000). O kwukwara na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari zụkwara akpaụkwụ dị puku iri abụọ na ise maka ndị gbara ọsọndụ. Cheta na onyeisiala nyere iwu nke akpọrọ 'Executive Order No 3' nke kwuru na onye ọ bụla ga na-azụ ngwaahịa ndị emepụtara na Naịjirịa. Nke a bụ iji kwalite ihe ndị emepụtara n'Aba n'akwa Naịjirịa gbaa gburugburu." 44563299,https://www.bbc.com/igbo/44563299,Ndigbo: Ọgbaehi bụ ịtụnye ego ọha n'ahịa onwe,Otu Ohanaeze na ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti mapụtara ịrụ ọgbaehi na steeti iri na Naijiria.,"Nnaji, Uwazuruike na Okeke-Ogene: Ndigbo achọghị 'ranching' Ha kwuru na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya gọọmentị iwere ego ọha were na-ahaziri ndị nọrọ onwe ha ihe ha ji achụ ego aka ha. Ngalaba gọọmentị etiti na-ahụ maka ihazi akụnaụba ala anyị nke a kpọrọ,'National Economic Council (NEC)' na bekee nke osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo nọ n'isi ya, binyere aka n'akwụkwọ atụmatụ ịkpa anụmanụ n'afọ iri na-abịa nke a kpọrọ 'National Livestock Plan' na bekee. N'ime atụmatụ ahụ nke ga-eri ijeri naira 179, gọọmenti etiti nwere ebumnobi ikewapụta ọgba ehi (ranches) iri itoolu na anọ na steeti iri. N'okwu ya, onye bụbu onyeisi Aka-Ikenga bụ Goddy Uwazuruike sị: ""Ịchị ehi (maọbụ nke Igbo maọbụ nke Awụsa) bụ ihe mmadụ na-emere onwe ya. Kedu ka ị ga-esi were ego ọha nwere were tinyere ndị ụfọdụ ka ihe ha na-eme na-aga ọfụma?"" Ọkaiwu Chima Nnaji kwukwara otu ihe ahụ. Ọ sị: ""Ihe gbasara ịchị anụmanụ bụ ahịa mmadụ na-azụrụ onwe ya, ọ bụghị gọọmentị. Ọ bụrụ na-emebe ya otu a, ụmụ Igbo na-anya ụgbọala."" Steeti ebe a ga-ebido atụmatụ 'National Livestock Plan' dịka gọọmenti siri kwuo, gụnyere Adamawa, Benue, Edo, Ebonyi, Kaduna, Nasarawa, Oyo, Plateau, Taraba, na Zamfara. Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Audu Ogbeh na onye nchịkọta atụmatụ ahụ bụ Andrew Kwasari nakwa gọvanọ na-achị Benue bụ Samuel Ortom bụ ndị nọchitere NEC oge ha na ndị isi ụlọọrụ akụkọ nwere ọgbakọ na'Abụja, gbara atụmatụ a n'anwụ. Ogbeh kwuru na,""ịchị ehi akpagharị adabaghịzị,"" O kwụkwara na ndị ga-eritekarị erere atụmatụ ahụ bụ ndị ọchịehi. Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị:" mba-uba-57147602,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-57147602,Rochas Okorocha metere ihe mere mmụọ jị achụ ya ọsọ - Gọọmentị Hope Uzodimma,Gọọmentị Imo steeti asaala okwu onye bụbu Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru banyere onye nọchịrị anya ya bụ Hope Uzodinma.,"Okorocha kwuru na Uzodimma kpọrọ ya asị dị egwu nke ya amaghị ihe kpatara ya dịka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels na-eme mkparịtaụka banyere ọnọdụ ọchịchị nakwa nchekwa na Naịjirịa ugbua. Dịka onye ntaakụkọ Channels bụ Seun Okinbaloye jụrụ Okorocha maka esemokwu dị n'etiti ya Uzodinma, ọ sị na ya anaghị esesa gọvanọ ya okwu, na ọ bụ ya na-esesa ya okwu. ""Amaghị m ihe mere Uzodinma. Ọ na-ebuso m agha oge niile mana ekwere m onwe me nkwa na agaghị m emegwara. Ọ na-emere m ụfụ anya."" Rochas na ama anyị aka n'ihu - Gọọmentị Imo Okorocha gara n'ihu kwuo na ndị uweojii jichiri ndị ọkwọ ụgbọala ya nakwa ndị ọrụ ya ndị ọzọ n'Imo steeti kamgbe abalị ise gara aga. ""Ugboro ugboro ka ndị uweojii jichiri m, ma n'Imo steeti ma n'Abuja,"" Rochas na-ekwu. ""Ugboro ugboro ka e mebiri ụlọ m na akụnụba m ndị ọzọ."" ""Mana n'ime ihe niile a, ihe m na-ahụ bụ naanị akpọmasị, o nweghị ihe ọzọ."" Okorocha gara n'ihu kwuo na ya ma na ya busowe Uzodinma agha ọ ga ebute nsogbu karịa nke a na-ahụ ""n'ime steeti m tara ahụhụ wunlite"". Ọ kọwara na a na-ebo ya ebubo nrụrụaka mana nke bụ eziokwu bụ na ya nwere ego tupu ya abụrụ gọvanọ. ""Ihe ndị mmadu na-echezọ bụ na abụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ."" Imo Elections: ""A dọrọ m Rochas aka na ntị maka APC, ọ jụ"" Gọọmentị Hope Uzodimma, n'ozi Ode Akwụkwọ Mgbasaozi ya bụ Ogwuwike Nwachukwu binyere aka, sị na ọ bụ mkpọtụ ka Okorocha na-eme. Ha sị: ""Ndị Naịjirịa ekwesighi ige ya ntị. Ọ bụ mmụọ ya na achụ ya maka etu o siri mebie steeti ọ chịrị afọ asatọ."" Ozi a sị na ebe ndị Imo ""nwere ike ịgbaghara ya mana ha enweghi ike ichefu ihe o mere ha"". Ha sị na Gọvanọ Hope Uzodimma na-ekpochapụ ihe niile Okorocha mebiri." afirika-45003821,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45003821,Osita Okechukwu: Igbo wepụ uche na 'resturcturing',Onyeisi ụlọ mgbasa ozi Voice of Nigeria (VON) bụ Osita Okechukwu ekwuola na ọ kaara ndị Igbo mma ịchọwa onyeisiala 2023 karịa ịkwuwe okwu ihazigharị obodo Naịjirịa.,"Ndịgbo na ndị agbụrụ ọzọ zukọrọ n'Awka ịkpa maka ""restructuring"" N'okwu ya, ịchụwa ọkwa onyeisiala nke 2023 ka nso karịa ị chọwa ka a ga-esi hazigharịa obodo Naịjirịa. O kwuru na ọ fọro naanị afọ anọ ka onyeisiala Buharị chizuo. Okechukwu bụ onye otu APC kwukwara na ọbụrụ na Igbo kwado Buharị, Buharị akwado Igbo n'ịnweta ya bụ ebum n'obi nke pụtara na onye keele Sunny, Sunny ekeele ya. N'aka nke ọzọ Okpani Nkama bụ otu n'ime ndị ọnụ na-erụ n'okwu n'Ohaneze Ndigbo sara Okechukwu na ""ọ bụ uche ya ka ọ na-akọ"". N'okwu ya ""uche onye adịghị ya njọ"". Ọkpanị kwuru na ihe Ohaneze na ọrụ na Igbo kpụ n'ọnụ bụ ka a ga-esị hazigharịa obodo Naịjirịa nke ga-enye aka ka egbe bere ugo bere. Otu onye ọnụ na-eru n'okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya agaghị ewetu onwe ya ala ịsawa Okechukwu okwu maka na ọ bụ ihe a tụrụ anya ka onye nọ na ọnọdụ ya kwuo ka a ghara ịchụ ya n'ọrụ. Onyeisiala Naịjirịa dị Igbo nso karịa 'restructuring'- Osita Okechukwu Ọ rịọrọ BBC Igbo ka ha ghara ịkpọ aha ya maka na ọ achọghị itinye ọnụ na-ụdị okwu ahụ na-erijughị afọ. Akụkọ ga-amsị Ndị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu" afirika-44249586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44249586,Innoson ekwuola na ọ bụ mmbebọ ka ụlọikpe chọrọ ime ya,Onyeisi ụlọọrụ Innoson bụ Innocent Chukwuma asaala mkpebi ụlọikpe nyere ka edenye ka onye a na-achọ achọ na Naịjiria were sị na ịkpọ ya onye a na-achọ achọ bụ ụzọ ha si achọ imebọ ya.,"Innocent Chukwuma bụ onye ama ama dịka onye na-ịtụkọta akara-ngwa ụgbọala na Naịjirịa Chukwuma, bụ onye ejiri Innoson mara kwuru na ụjọ anaghị atụ ya ị ga ụlọikpe, kama na ekwesịrị ịkpụpụta ya n'ụzọ ziri ezi. Cheta na ndị ụlọikpe kpọrọ ya onye a na-achọ achọ makana ọ pụtaghị n'ụlọikpe ugboro ise ịza ajụjụ gbasara ebubo mpụ na aghụghọ ndị EFCC na-ebo ya. N'ime akwụkwọ Chukwuma dere ụnyaahụ, o kwuru na ụlọikpe nke Lagos kwesiri ịkọwa ihe mere ọ ga-abụ ebe ahụ ka a ga-elebanye anya n'ikpe a? O kwuru na ya edeela akwụkwọ gbasara okwu a n'ụlọikpe nke etiti na Lagos, na kwa ụlọikpe nke etiti ka-elebanye anya na ihe a o dere. Innoson jụrụ ihe mere ikpe ya ka jiri dị n'aka okaikpe Mojosola Dada ka na-eleba. Gịnị bụ ebubo a? EFCC kwuru na Innoson ji n'aghụghọ na ụzọ n'akwụghị ọtọ wee nara ngwọọrụ e ji arụ ọgba tum tum, na ihe ndị ọzọ e ji arụ ụgbọ site n'aka Mitsui OSK dị n'Apapa Legos. Innoson ka na-agọ ebubo a niile, na kwa kwuo na ya na-ekpesa ikpe a." afirika-43576605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43576605,Ewepụla kọmishọna uweojii Kogi kwuru sị chọta Dino Melaye,"Onyeisi ndị uweojii gburugburu Naịjirịa bụ Ibrahim K. Idris, ewepụla kọmishọna ndị Kogi steeti bụ Ali Janga ka o nyechara iwu sị chọta sinetọ Dino Melaye.","A ma Dino Melaye dịka onye na-ekwuputa uche ya gbasara ọchịchị na Naijịria N'akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood zitere, o kwuru na Idris họpụtara Esa Sunday Ogbu bụbụ kọmishọna nke Federal Operations nke isiụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja, ka ọ nọchie Janga ewepụrụ. Idris kwuru na ihe mere o jiri wepụ Janga n'ọkwa bụ maka na ọ ghọtaghị etu mmadụ isii bụ ndị anwụchiri anwụchi a na-enyo enyo ga-esi gbapụ n'ime ebe ndị uweojii dobere ha n'isi ụtụtụ Wenesde. O kwuru na Janga emeghị ka onye ihe gbasara, na ọ kpazighị agwa ọfụma. N'ime mmadụ isii ahụ gbafuru agbafu, mmadụ abụọ tụrụ sinetọ Dino Melaye aka, sị na ọ bụ ya nyere ha egbe ndị uweojii hụrụ n'aka ha. Ndị uweojii nyere iwu sị 'chọta Dino Melaye' ma tinye aha ya na ndị Interpol na-enyo enyo. Ndị isi uweojii kwuru sị na ndị uweojii ahụ ndị a na-enyo enyo gbanahụrụ, ga-ata ezigbo ahụhụ gbasara ya." afirika-44598610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44598610,Plateau: Buhari mee ihe karịrị ozi itiakanobi,Ndị uweojii kwuru na mmadụ ruru iri asatọ n'isii anwụọla n'ọgụ dara n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụụgbo na Platu steeti.,"Ọgbaaghara yiri nke a mere n'afọ 2001 n'obodo Jọs, Platu steeti Ya mere onyeisiala bụ Muhamadu Buhari jiri zigara ndị steeti ahụ ozi itiakanobi iji kasie ha obi maka ihe mwute a mere. N'ime ozi ya, o kwuru na ọ ga-agba mbọ ịhụ na a nwụchiri ndị mere nke a ma kpee ha ikpe ka o si kwesi. Mana obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma maka akụkọ a ebe ha gosiri iwe ha n'elu soshal midia. @Renoomokri kwuru na ọ dịka Buhari ezitere ozi ochie ya n'agbanweghị ihe ọbụla n'ime ya. @es_adelore kwuru ka gọọmentị etiti mee ihe karịrị izi sọsọ ọzị kwa izuụka ihe mere. @Terna71 kwuru na ọ bụ otu ozi a ka Buhari kpụ n'ọnụ kemgbe ndị Benue na-anwụ. @AlphamaleSMG kwuru na Buhari na-akwado ịme njem na Kalaba kama ị ga leta ndị Platu steeti. Ozi ndị Buhari zipụtere gbasara oke ogbugbu dị icheiche Ihe mere ụfọdụ mmadụ jiri ewesara Buhari iwe bụ na ozi ya niile ọ na-ezite na eyi onwe ha. Ha na-ekwukwa na o zipuchaa ozi ndị a ma kwechaa nkwa, ogbugbu ka na-aga n'ihu. Lee ozi ndị o zipuru n'oge gara aga n'akara soshal midia ya ebe a: Ụbọchị 3 ọnwa Jenụwarị afọ 2018 N'akwụkwọ ọ depụtara n'ụbọchị ahụ site n'aka onye enyemaka ya Garba Shehu, ọ katọrọ ogbugbu ndị mmadụ na Benue steeti kpọọ ya ajọ ihe. Ụbọchị 1 ọnwa Febụwarị afọ 2018 Ụbọchị 24 ọnwa Eprelu afọ 2018 Ụbọchị 24 ọnwa Juun afọ 2018" afirika-49903736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49903736,Megan Markle: Harry agbaala 'Mail on Sunday' akwụkwọ maka ụtọ ndụ ya,Megan nwunye 'Duke' nke Sussex amalitela ikpụpụ ụlọọrụ mgbasaozi 'Mail on Sunday' ulọikpe.,"Ọ bụ maka etu ha si wepụta akwụkwọ ozi ""nke ọ chọghị ka ọha hụ' tiwasara ọha ka ha gụọ. N'akwụkwọ ozi di ya bụ Harry depụtara ,o kwuru na ha gara n'ihu mee nke a m,aka etu ndị ọjọ si chọọ imetọ ugwu nwunye ya. Harry kwuru: Nnem nwụnahụrụ m mana ugbua a na m ele nwunye m ka ndị ike meminara nnem chọro imemina ya."" Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ 'Mail on Sunday' kwuru na ụlọọrụ agaghị ehichapụ akụkọ ahụ makana ha dị njikere ịzara ọnụ ha n'ụlọikpe. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a @dontjealousme kwuru na ọ ghọtaghị ihe mere aha Megan ji ewukarị n'ihu akwụkwọ ụlọ mgbasaozi ọbụla. @Windfall68 kwuru na ihe ha mere dị mma Akụkọ ga-amasị gị Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo?" afirika-43786645,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43786645,Nwoke anarala ụtarị ruru 80 maka ịkpọ nwaanyị akwụna,Ụlọikpe nọ na Magajin Gari dị na Kaduna nyere ka Shuaibu Umar nara mpiampia ụtarị 80 maka na ọ kpọrọ nwunye nwanne ya bụ Suwaibu Abdulkadir onye akwuna.,"Iwu sharia na-abụkarị isiokwu ndọrọndọrọ n'etti ndị alakụba omenala na ndị mgbanwe ihe. Abdulkadir onye kpopụrụ nwanne di ya n'ulọikpe maka mmetọ aha gwara ụlọikpe na Umar kpọrọ ya akwụna maka nghọtaghie ha nwere. N'okwu Abdulkardir, ""Achọrọm ka ụlọikpe a nye m ikpe kwụ ọtọ gbasara ajọ aha Shuaibu kpọrọm."" Shuaibu agọnahụghị ebubo a kama o kwuru na ọ kpọrọ Abdulkadir akwụna n'iwe nakwa o nweghị nwute. N'okwu Shuaibu, ""Obi gbawara m mgbe ọ kporọ m onye ọgwụ na onye ohi."" Onye ọkaiwu ukwu bụ Mallam Dahiru Lawal kpebiri ka a pịa Umar ụtarụ ruru 80 ka o nyechara ya ohere ị weghachị okwu ọjọ ahụ. N'okwu onye ọkaikpe ahụ, ''Ikpe a sonyere nkuzi onye amụma Mohammadu nke kwuru na mmadụ e nweghị ike ibo onye ọzọ ebubo mpụ ma ọ bụrụ na enweghị mmadụ anọ hụrụ ka onye ahụ na-eme mpụ."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46916034,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46916034,Nigeria 2019 elections: Njirimara ndị na-azọ oche Onyeisiala – Atiku Abubakar,Atiku Abubakar bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Naịjirịa nakwa onye ojiegoachụego bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa site n'afọ 1999 rue afọ 2007.,"Aha ya na-apụta n'akwụkwọ ntụlịaka ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ dịka Umar Yar'Adua meriri ya n'afọ 2007. Atiku bụ onye ndọrọndọrọ siri ike, nke pụtara na ọ nọọla na ya ihe ruru afọ iri anọ kemgbe ọ batara n'afọ ndị 80's mgbe ọ si n'ụlọọrụ ndị mbubata na mbupu nke Naịjirịa pụta. Anya ya bidoro ịbanye n'ọkwa onyeisiala kemgbe afọ 1993 mana onweghi ike ịnwezu vootu kwesiri ịme ka ọ bụra ya ga-ebu ọkọlọtọ pati ya. N'uche ndị ọnụ na-eru n'okwu, ọ na-eme ka ndị ndọrọndọrọ Afrịca maka etu o sị achụsị ọkwa n'ike. N'agbanyeghi na ọ gbanwela otu ndọrọndọrọ ụfọdụ oge, o mezubeghi uche ya. Atụrụ Atiku aka n'akụkọ ị na-aka azụ nke mba ofesi gụnyere otu onye omeiwu nke mba Amerịka akpọrọ Williams Jefferson n'agbanyeghị na ọ ọ gọrọ ụka na aka. Ndị ilo ya na-ekwu na a ga-anwụchi ya ma ọ gaa mba Amerịka ebe ndị otu ya na-ekwu na aka ya adịghị n'okwu ahụ. Atiku gara Amerịka n'ụbọchị nke 17 ọnwa Janụwarị 2019. Maazi Abubakar bụ onye ụka alakụba sị na mpaghara ụgwụ Naịjirịa dịka ogbo ya bụ Onyeisiala Muhammadu Buhari. Ozi achumnta vootu ya na-eleba anya n'iweputa ọrụaka nakwa ịhazi akụnaụba Naịjirịa. Otu ndọrọndọrọ ya bụ PDP chịrị Naịjirịa afọ iri n'isii mana patị ọhụrụ site na ndị gbakọrọ aka - APC meriri ha nke ọtụtụ mmadụ na-akatọ na ha anaghị emezu ihe iji gboo mkpa ala ahụ bụ ọkụ latrik, mpụ na nchekwa ezighi ezi. N'uche ndị ọkachamara, ntụlịaka nke ụbọchị 16 n'ọnwa Febụwarị bụ sọsọ n'etiti Atiku Abubakar na onye nọ n'ọkwa ugbua bụ Muhammadu Buhari. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52182506,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52182506,Working From Home: Ụzọ asaa ị ga-esi baara onwe gị uru ma rụọ ọrụ n'oge mmachi maka coronavirus,"Dịka ọtụtụ mmadụ nọ n'ụlọ na mba dị iche iche nke gụnyere Naịjirịa mere mmachi ngagharị na nnọkọ mmadụ maka ọrịa coronavirus, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị etu ha ga-esi eme n'ihi na ịnọ n'ụlọ amaghị ha ahụ.","Kama, echegbula onwe gị n'ihi na anyị na-ewetere gị ụzọ asaa ị ga-eji baara onwe gị uru dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ n'oge mmachi a. Ihe atọ ị kwesịrị ị bụ n'obi dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ bụ Nghazi, oge mmecha na ezumike. Ọ bụ site na ihe atọ ka ụzọ asaa a sị pụta. Ngwa ka anyị zọpụ ije: 1) Chọta nkọrọ dị ahụ gị mma: Oge eruola ị ga-eji hazie obere ebe ị ga-akpọ ụlọọrụ n'ụlọ gị. Chọta ebe dị ahụ gị mma nke mmadụ agaghị enye ndụ gị nsogbu. Gba mbọ hụ na ihe na abata ebe ahụ nke ma. Ma ya bụrụ kwa ebe ụbụrụ gị ga-edere duu ka ị rụọ ọrụ gị nke ọma. 2) Ekwela ka enwee ihe ga-arafu uche gị : Ọ bụrụ na mmadụ anọghị n'ụlọ ọrụ ya, itinye uche na ihe ọ na-eme na esi ike n'ihi na ọtụtụ ihe nwere ike irafu uche gị. E nwere ìgwè na adị n'ime ekwentị ga-enyere gị aka ka uche gị hapụ ị pụ n'ọrụ. Maka Ihe gbasara iru ọrụ nke ọma igwe aap dịka ""cold turkey"", ""proud"" na ""rescue time"" ga enyere gị aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na ndị ọrụ gị rụkọọ nke ọma igwe aap dịka ""zoom"", G-suite"", ""Bannersnack"" na ""slack"" ga enyere aka nke ukwu. 3) Hazie ụbọchị gị ma tinye uchu na ihe ndị kacha mkpa: Etu m siri ebi ndụ m na London kemgbe mmachi ngagharị malitere Ọ dịkwa ezigbote mkpa ka ị were atụmatụ iji arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ were ya na-arụkwa ọrụ ugbu a ị nọ n'ụlọ. Ọ dịkwa mkpa ka ị bido n'ụtụtụ hazie ụbọchị gị, wepụta oké ị ga-eji rụọ ọrụ dịka ị na edetu ihe niile ị ga-eme n'ụbọchị ahụ. 4) Hụta na ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ghọtara gị mgbe niile: I si n'ụlọ arụ ọrụ dị iche nke mere na ọ dị mkpa na ị hụrụ na ndị gị na ha na-arụkọ na-ghọta gị mgbe ọbụla. Ịkpọ na ekwe ntị nke ihe onyonyo kpọrọ ""video call"" na enyere aka nke ukwu. Ọ dịkwa mkpa na ị jụrụ ajụjụ mgbe ọbụla enwere ihe ị na-aghọtaghị. 5) Kwado nke ọma tupu ị banye ọgbakọ n'ekwenti: Gbaa mbọ hụ na ị kwadoro onwe gị nke ọma tupu ị banye n'ogbakọ ekwe ntị. Hụ kwa na ihe nwere ike irafu gị dịka ìgwè onyonyo tivi, redio ma ọbụ ndị ọzọ gbanyụrụ agbanyụ. Ọ dịkwa mma ma ahọpụta otu onye ka edu ndị ọzọ na nzukọ ahụ. 6) Nye onwe gị oge ezumike nri : Gbalịa hụ na ị nyere onwe gị oge ezumike ị ga-eji rie nri dịka ị si n'ụlọ arụ ọrụ. Nke a ga-enyere aka ka ụbụrụ gị zuo ike. Erikwala nri dịka nzukọ na-aga. Isi nri nke gị bụ kwa ezigbo ohere inye onwe gị ezumike. 7) Echefu kwala izu ike: mmadụ abụghị ìgwè. Gbalịa hụ na ị zuru ike. Were ohere ezumike a, hazie ụlọ gị, kpọtụrụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị n'ekwe ntị, maọbụ mụọ ihe ọhụrụ. Ihe kacha mkpa bụ na ị nyere onwe gị oge ezumike." afirika-46793646,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46793646,"Nigeria election 2019: Ọ bụrụ na Ndigbo ekweghị, e kwenyere anyị - Ifeanyi Olumba",Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo etinyela ọnụ n'ihe gbasara ọnụọgụgụ Ndigbo bị n'ọwụwa anyanwụ ga-atụ vootu na ntuliaka na-abịa.,"Ifeanyị Olumba bụ okwuru ọha gwara BBC Igbo gwara na ọ gbagojuru ya anya etu o si bụrụ naanị ndị nọ na mpaghara 'Ọwụwa anyanwụ ruru nde iri denyere aha n'akwụkwọ. O kwuru na ọtụtụ Ndigbo si mba ofesi gara n'ala Igbo ga debanye aha mgbe a na-anata ""PVC"". Olumba kwuru na ọ bụrụ na Ndigbo apụtaghị were PVC ha n'uju mgbe ahụ na ihe ọ pụtara bụ na ndị ọzọ ga-ahọpụtara ha onye ga-achị ha. Onye ọzọ nwere echiche pụrụ iche bụ Ike Abonyi, onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na ọnụọgụgụ ahụ a gụnyeghị Ndigbo nọ na mba ọzọ dịka Legos. O kwuru na Ndigbo bi na mba ndị ọzọ ka ndị bi n'ọwụwa anyanwụ ya mere n' ọnụọgụgụ ahụ enweghị ihe o mebiri. Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ntụlịaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission(INEC) ekwuola na mmadụ nde asatọ na ọma debanyere aha maka ntụlịaka na-abịa. Onyeisioche ha bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a na nzukọ ndị isi ala n'Abuja. Kedụ mmadụ ole bi n'ọwụwa anyanwụ ga-ebinye aka na ntuliaka a? N'ime mmadụ nde iri asatọ ga-ebinye aka na ntụlịaka na-abia, ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ(South east) pekarịchaa na mpe. Ha dị mmadụ nde iri. Ndị kachasị were denye aha maka ntụlịaka a bụ ndị ndịda ugwu(North West) dị nde iri-abụọ. Ọnụọgụgụ a ji pasenti otu gafee nke afọ 2015 bụ 11 pasenti. Ntụlịaka nke onyeisiala ga-amalite n'ụbọchị Satọde bụ 16 Febụwarị, tinyere ntụlịaka nke ndị gọvanọ na ụlọomeiwu obere bụ ụbọchị Satọde, 2 March, 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44612156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44612156,Plateau: 'Oke ihe anya mmiri mere',Ụfọdụ ndị gabigara ihe ize ndụ na Plateau steeti akọwala ihe anya ha hụrụ n'ogbugbu ndị mmadụ ahụ.,"Akụkọ kwuru na e gburu mmadụ ruru iri asatọ na isii n'ọgbaghara ahụ mere n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụugbo mana ndị hụrụ ihe mere kwuru na ọnụọgụgụ a nwereike ịkarị. Onyeisiala gara steeti ahụ ụnyaahụ wee rịọ ka ndị mmadụ ghara itinye iwu n'aka ha ma hapụrụ ndị ọrụ nchekwa ọrụ ha ichekwa obodo. Onyeisiala kwuru nke a ka ndị otu ọchịehi Miyetti Allah Cattle Breeders Associaltion kwuru na ihe kpatara ya bụ mmemina bụ na ndị obodo ahụ gburu ehi ha ruru narị atọ. Ndị agha ""Operation Safe Haven"" kwuru na ha anwụchila mmadụ iri na atọ a na-enyo nwereike iso n'otu abụọ ahụ butere ọgbaghara ahụ mere." afirika-46629921,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46629921,'2019 Budget agaghị ezu Naịjirịa',"Wenesde 19 Dizemba, 2018 bụ ụbọchị Onyesiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari wepụtara akwụkwọ ọ chọrọ iji me iwu mpata na mefu nke Naịjirịa n'afọ 2019 nke Bekee kpọrọ ""Budget"".","Bọọjetị ọhụrụ a Buhari nyere ndị Omeiwu ka ha nyocha bu tarị naira asatọ na ọma. Ya bụrụ na ndị Omeiwu kwenyere na ya, ọ ga bụrụ bọọjeị kachasị kemgbe Naịjirịa malitere. Buhari na pati ya bụ All Progressives Congress (APC) sị na bọọjetị a bu nke ha chọrọ iji bụlịe Naịjirịa n'ọnọdụ ha kpọrọ ""Next Level"", bụ aha ha nyere ịchụ nta vootu 2019 ha. Ka o sị dị ugbua, amabeghgị ma ndị Omeiwu a ga-ekwenye na ya, maọbụ weputeye ọsị ịsọ. Owere ha ọnwa isi iji kwenyere na bọọjetị 2018, agbanyeghi na Buhari nyere ha ya n'ọnwa Novemba 2017. Bọọjetị kachasị? Agbanyeghị na bọọjetị a bụ nke kachasị n'ọnụọgụgụ na naira, o nwere ndị tụrụ aka na ya bụrụ na ọ bụ dọla ka e ji tule ya, bọọjetị a pere mpe karịa nke afọ 2014. Bọọjetị 2014 putara ijeri $30, ka nke afọ a pụtara ijeri $24, dịka ụlọntaakụko Blomberg siri dee. Nke a bụ makana ike ego Naịjirịa bụ naira bidoro dawa n'ike kemgbe afọ 2014. Narị naira 360 na ọma na ego otu dọla ugbua, mana o nwere mgbe o ruru narị naira 450. Emu a kwara Buhari n'ụlọomeiwu akpatala okwu na-soshal midia Ihe ndị mmadụ kwuru maka Bọọjetị 2019 Budgit, bu ngalaba abụghị nke gọọmentị na-etinye anya n'ihe mkpata na mmefu gbariri bọọjetị 2019 etu a: Cheta Nwanze bu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere gọọmenti gwara BBC na bọọjetị nke 2019 adaala tupu ọ bụrụ iwu. ""Etinyere na ego a ga-eji mee ihe dịna bọọjetị a ga-apụta site na mmanụ agbịdi erere $59, taa, mmanụ agbịdị na-adazị $55. Nke mere na o nweghi ebe bọọjeti ji azụ aga,"" Nwanze kwetekwara na ego dị na bọọjetị a perempe ma ya bụrụ na e ji dọla tule ya. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya bụrụ na ekee ego bọọjetị kwa mmadụ niile nọ Naịjirịa ọ ga epe mpe. Ego eji akwụ ụgwọ ka nke eji arụ ọrụ na bọọjetị nke afọ a Nwanze sị; ""Ọ bụ ntụlịaka dị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'obi ugbua. Anyi aghaghị ahụ bọọjetị a anya ruo Eprel 2019."" Dọkịnta Ugo Egbujo bụkwa onye ọzọ ọnụ ya n'eru n'okwu kwenyere n'ihe Nwanze kwuru, ma kwuo sị na agụpụ ego eji akwụ ụgwọ, ego ndị ọzọ bu ihe ekwesiri ịgụ na dọla. Ọ sị; bọọjetị abụghị nsogbu anyị, makana ọ bụ ihe Bekee kpọrọ estimate. Ihe bụ nsogbu bu ebe ego ahụ ekwesiri ịgbarị na ya bụ bọọjetị ga-esi pụta."" Ọ gara n'ihu kwuo na Naịjirịa kwesiri inyocha etu a ga-esi melata etu e ji amụ nwa, ""makana ọ bụ oke ịmụta nwa mere ego ejighi ezu."" Ọ sị; ""N'afọ 2017, Naijirịa si na ọ ga-akpata tarị naira iri na isii, mana ihe akpara bụ tarị naira abụọ. Akpaghị, ebite ebite, mana Naịjirịa adịghị ebitenwu etu o si chọọ."" Ọnyeisi ndị omeiwu bụ Bukola Sarakị mechara katọ ya bu bọọjeti, ma kwuo na ọbụghị ihe ga-abara Naịjirịa uru. Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị" afirika-43736058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43736058,Champions League: Real Madrid na Bayern Munich bụ ndị mmeri,Ndị Real Madrid mewara ndị Juventus obi ka ha ji otu ọkpụ goolu gbapụ ha n'asọmpị Champions league.,"Cristiano Ronaldo nyere goolu nke iri anọ na otu nke afọ a n'ime asọmpi nke a N'agbanyeghị na Juventus nyere goolu atọ n'abalị ụnyaahụ, goolu atọ ndị Madrid nyere ha na be ha tinyere otu nke ụnyaahụ, mere ka ha gafee banye na ọkara-ikpeazụ. Mana Juventus tinyere nnukwu egwu n'ime ndị Real Madrid oge Mario Mandzukic nyere goolu abụọ n'ime nkeji abụọ eji bido egwuregwu nakwa n'ime nkeji iri atọ na asaa. Blaise Matuidi nyere goolu nke atọ. Ọ bụ goolu Cristiano Ronaldo ji penariti nye n'ime nkeji ise etinyere ka nkeji iri itoolu (90) eji agba ya bụ egwuregwu gachara, bụ ihe nyere Real Madrid mmeri. N'agbanyeghị na Arjen Robben bụ onye egwu ndị Bayern enyeghị goolu n'egwuregwu a, Bayern gafekwara n'ọkara-ikpeazụ N'asọmpị ndị Bayern Munich na Sevilla ụnyaahụ, onweghị onye nyere goolu ọbụla, mana Bayern ji ọkpụ abụọ asataghị otu wee mmerie Sevilla na nchịkọta goolu ha. Ndị otu ga-agba n'agba nke ọkara-ikpeazụ bụ Liverpool, Roma, Real Madrid na Bayern Munich. Ogbubọọlụ Michael Oliver na onyenchebọọlụ Gianluigi Buffon Nke a bụ nke mbụ Buffon bụ onye nchebọọlụ ndị Juventus na-anara akwụkwọ nchupu n'asọmpi Champions League Mana ọtụtụ mmadụ ka na-ekwu uche ha gbasara nchụpụ Michael Oliver chụpụrụ onye nchebọọlụ Gianluigi Buffon. Asọmpi a bụ nke ikpeazụ Buffon dị afọ iri anọ ga-agba n'asọmpi Champions League. Oliver nyere Buffon akwụkwọ nchụpụ maka na ọ gbara ọnụ ọjọọ gbasara mkpebi Oliver kpebiri oge o nyere Real Madrid penariti ha ji merie Juventus. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43257523,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43257523,Ndị mgbasa ozi a churu n'ọrụ,Akụkọ na-eru anyi nti na-ekwu na a chụọla ndị ọrụ ruru nari atọ n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi a kpọrọ Ait dị na Naijiria.,"Akụkọ na-ekwu na eji ndị ọrụ AIT ugwọ ọnwa ruru ọnwa iri na atọ. Nke a na-abia ka oji otu ụbọchị gafee a chụrụ ndị nọ n'isi oche akwụkwọ mgbasa ozi a kpọrọ Sun Newspaper dikwa na Naijiria. Mgbe BBC Igbo kpọrọ otu onye na-arụ ọrụ na AIT na-achọghị ka akpọpụta aha ya,ọ gwara anyị na ọ bụ ezumike nka ka mmadụ 330 a lara na AIT. Akwụkwọ kwuru na ya bụ achụmnọrụ bụ iji we doziarie ọnọdụ na ụlọ ọrụ Daar communications bụ aha isi AIT. BBC gbakwara otu onye n'ime ndi a chụrụ na Sunnewspaper ajụjụ ọnụ, ọ sị na chọghị ka kpọputa aha ya mana o kwuputere uche ya. Onye ahụ kwuru na ọ ka nọ na Abuja ebe o mere njem mgbe ozi achum n'ọru a rutere ya nti. O kwuru na ọ bata Lagos na ọ ga ga nata akwukwọ achụmnọ ọrụ ya mara ihe dị n'ime ya. kedu ihe otu na-elekota ndi mgbasa ozi na naijirịa na-ekwu? Onye isi otu na-elekọta ndi mgbasa ozi na Naijiria akpọrọ Waheed Odusile kwuru na ya na ndi otu ya ga-enyocha ihe a mere nụ ka ha chọpụta ihe kpatara ya. O kwuru na ọ bụrụ na o nweghị ihe ọjọọ ndị a mere,ha ga-agba mbọ hụ na enyere ndi a ego niile diara onye ma ọ kwusi ọrụ. O kwukwara na ihe nke a wutere ha nke ukwu maka na obodo bụ igwe kita." afirika-44957920,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44957920,Ị nwere ike ịgba ara ma ị nweta onwe gị n'ụlọ mkpọrọ,Ụlọ mkpọrọ na mba ndị ọzọ bụ ebe a na-ahazi ndị mmadụ ma mezie agwa ha iji weghachite ha n'ime obodo dịka ndị gbanwere agbanwe.,"Ule ụlọ mkpọrọ Mana ọtụtụ ndị na-eleta ndị mkpọrọ ekwuola na ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa anọghị nso ịbụ ebe mmezi maka ụfọdụ ihe ha kpọpụtara. Onyeisi otu na-eleta ndị mkpọrọ a na-akpọ Carmelite Prisoners Interest Organisation (CAPIO) na Bekee bụ Fr. Ambrose Ekeroku, gwara BBC na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa bụ nke na-agba anya mmiri. Fr. Ambrose kwuru na ihe ruru mmadụ 60 n'ime ụlọ mkpọrọ n'Enugwu bụ ndị isi na-adịghị mma. O kwuru na ụdị ndị ahụ nọ n'ogige a rụpụtara ndị isi adịghị mma nọ n'ime ụlọ mkpọrọ nke a kpọrọ 'Asylum' na Bekee. Fr. Ambrose kwuru na ihe dị mwute karịa bụ na ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ enwetabeghi ezigbo nri ma ya fọdụ inweta ọgwụgwọ maka ndị isi mgbaka. O kọwara na ọnọdụ ndị nọ na mkpọrọ nọ abụghị ihe dị mma cha cha nke anaghị aba uru ha chọrọ ka ọ baa maọbụ gbanwe ndị nọ n'ime ya. Ụfọdụ ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa dị njọ karịa etu a N'okwu ya: ""Ọtụtụ ụlọ mkpọrọ dị na Naịjirịa bụ nke ndị ọcha rụrụ nke kwesiri ibu mmadụ 600. ""Mana ugbua, ha na-ericha mmadị 30,000 nke bụ na ebe niile kpara mkpa karịa. ""Ị gaa ebe ahụ, ị hụ ka ebe niile na-esi isi, ọnọdụ mkpocha na nzacha adịghị mma, mmiri adịghị. ""Ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ nwee isi mgbaka ebe ahụ."" Ihe nwereike ibutere ndị nọ na mkpọrọ isi mgbaka Ọ kọwarana ụdị ndị a anaghị aga n'usoro ikpe maka na ndị nwe ya chọrọ ka ọ nọrọ ebe ahụ. Dịka o si kwuo, ndị nọ na mkpọrọ nwere isi mgbaka na-anọ iche n'ebe ndị ọzọ nọ mana ajụjụ bụ kedụ ka ha si enweta ọgwụgwọ? Kedụ ka ndị isi mgbaka si ebi n'ụlọ mkpọrọ? Ndị nwere isi mgbaka nọ n'ụlọ mkpọrọ na-anọ n'ime ụlọ nke ha dị iche na mkpọrọ niile. Fr. Ambrose kwuru; ""Ha nwere mgbidi nke ha, nwee mgbo nke ha dịka ""mkpọrọ n'ime mkpọrọ"". O kwuru na ha anaghị enweta ọgwụgwọ ọbụla na-abụghị nke ndị otu ha bụ CAPIO na-arụ ọrụ enyemaka n'ụlọ mkpọrọ site na ndị dibia bekee ha na-akpọta na-enye. O nweghizi ọgwụgwọ ha na-enweta maka na ha anaghị eri nri nke ọma, ya fọdụzie inweta ọgwụgwọ. N'okwu Fr. Ambrose.""Ọgwụ ndị isi mgbaka na-agara ọnụ nke ukwu, maa gọọmenti enyebeghị ha ezigbo nri, ma ya fọdụzie ọgwụ ndị ahụ."" N'akụkụ nke ya, otu onye na-arụ n'otu a na-akpọ Clara Innocent onye ọrụ CAPIO gwakwara BBC Igbo na e nwere dọkita maka isi na-anọ n'ụlọ mkpọrọ mana o nweghị ngwọrụ o ji arụ ọrụ. Ọ kọwakwara na otu ha na otu ndị ọzọ na-agbọ ịleta ndị mkpọrọ n'ụzọ kwesiri ekwesi. BBC Igbo gbara mbo inweta ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ụlọ mkpọrọ mana ọ gaghị nke ọma. BBC Igbo gara ileta ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ n'Ikoyi Lagos ebe ha lere ule UTME ma jụta kwa ha ihe bụ ọdịnihu ha n'afọ a. Ule ụlọ mkpọrọ Akụkọ ga-amasị gị:" 45224349,https://www.bbc.com/igbo/45224349,Lee ihe ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye mere oge mkpa mmekọrịta ji ha,Di na nwunye ịnọkọ bụ ihe dị oke mkpa n'ezinaụlọ n'ihi na ọ na eme ka adịmma ha tọọ atọ.,"'Ihe pụrụ iche mere oge mkpa mmekọrịta ji m' Mana ọtụtụ oge, ọrịa, esemokwu, ụzọ ite aka, maọbụ aghọtaghị mkpa mmekọ nwoke na nwunye dị nwere ike ime ka nnọkọ bụrụ ihe dị mfe. Mkparịta ụka a malitere maka akụkọ pụtara na Nwoke 'kọnji' ji dinara nwunye ya n'ụlọọgwụ na mba Uganda. Na mkparịụka BBC Igbo na ụfọdụ ndị lụọra di na nwunye nwere, ha kọpụtara ihe ha merela oke ha nnoọkọ di nna nwunye dị ha oke mkpa: Mazị Kachi Okorie bụ nwoke lụrụ nwaanyị ọnwa anọ gara aga sị, ""Aka m nụrụ nwaanyị ọhụrụ. O yidera m, ọ na-enye ya mgbe ọbụla m chọrọ ya nkmke na abụkarị n'abalị ma m nata ọrụ."" Oriakụ Adaeze: ""Efeela m ụgbọelu si Legọs fega Asaba ga hụ di ebe ọ gara ọrụ n'Asaba. ""Sị nwoke lee ihe m chọrọ. Ya mee ihe o kwesịrị ime ka m gaghara ịgakwuru nwoke ọzọ. O nye m ya ozigbo,ozigbo n'ụlọọrụ ha."" Onyeka Nkeme kwuru na agụ ya na nwunye ya ịnọkọ ebugala ya njem isi Legọs gawa Calabar. ""Oge ahụ nwunye ji otu afọ efe ala nna anyị. A gbara ụgbọala gawa Calaba mụ na ya nọkọọ. Anọkwara abalị ole na ole tupu m lọghachi."" Mana e nwekwara ụfọdụ dịka Oriakụ Philo Okafor ndị kwuru na o nweghị ihe pụrụ iche ha merela ka nwere mkpa ịnọkọọ karịa ịgwa dị ya ma ọbụ nwunye ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" egwuregwu-46047995,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46047995,Leicester City: Etu ihe mberede si bute anyammiri nye ndị egwuregwu bọọlụ,"Na-erughị ụbọchị ole na ole gara aga, ụgbọelu bu onye nwe otu Leicester City dị na mba Ịngland kpọkasịrị ma gbuo mmadụ ise.","Nke a abụghị mbụ ihe mberede ụgbọelu maọbụ ụgbọala na-egbu ndị na-agba bọọlụ maọbụ ndị ọ masịrị. BBC Igbo chọrọ itule ugboro ole ihe mberede a merela. Ihe mberede ụgbọelu 1) Leicester City: Vichai Srivaddhanaprabha bụ onye nwe otu egwuregwu Leicester City na mmadụ anọ ndị ọzọ nwụrụ nso ọgbọ egwuregwu Ụbọchị 27 nke ọnwa Oktoba 2018 bụ nke ọtụtụ ndị egwuregwu bọolụ na-amasị agaghị echefu n'oge ọkachasị ndị na-akwado otu egwuregwu a. Ụgbọelu helịkọpta ahụ bu mmadụ ise gụnyere onye nwe otu ahụ. Ọ kpọkasịrị ka ha si n'ọgbọ egwuregwu ha felie ka ha lelechara otu asọmpi. Enweghị onye si n'ụgbọelu ahụ pụta. 2) Otu Chapecoense: N'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba 2016, ụgbọelu bu ndị na-agba bọọlụ na Chapecoense dị na mba Brazil, kpọkasịrị n'ugwu dị na mba Kolombịa. Ụgbọelu ahụ bu mmadụ 77 nke gụnyere ndị ọgbabọọlụ nakwa ndị ntaakụkọ so ha na-aga asọmpi Copa Sudamericana na mba Kolombịa. Naanị mmadụ atọ ji ndụ ha pụta n'ihe mberede a, mana ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a kwọjipụrụ ụkwụ ma nwetakwa mmerụ ahụ ndị ọzọ. 3) Otu egwuregwu Zambia: N'ụbọchị 23 nke ọnwa Epreelụ 1993, ụgbọelu ndịagha bu ndị Chipolopolo nke Zambia kpọkasịrị n'ime okeosimiri Atlantic. Ihe mberede a dakwasịrị ụgbọelu ahụ bu mmadụ 30 nke gụnyere ndị ọgbabọọlụ ka ha si obodo Libreville dị na mba Gabon efepụ. Enweghị onye si n'ime ụgbọelu ahụ pụta. 4) Otu Manchester United: Afọ 2018 mere ya afọ 60 ndị otu Manchester United dị n'Ịngland na ndị na-akwado ha na-echeta ndị otu ha nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Febụwarị 1958. Ihe mberede a dakwasịrị ụgbọelu ha bu mmadụ 44 (nke gụnyere asaa na-agbara ndị Man Utd bọọlụ) n'ọdọ ụgbọelu dị n'obodo Munich. Mmadụ 21 anwụghị mana ihe mberede a tara isi mmadụ 23 ụbọchị ahụ. Ihe mberede ụgbọala 1) Otu egwuregwu ndị nwere ọrụsị na Naịjirịa: N'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọktọba 2018, ihe mberede okporoụzọ dakwasịrị ndị nwere ọrụsị na-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpi Iko Mbaụwa nke egwuregwu bọọlụ. Ụgbọala bu ha aga Abụja kpọkasịrị, merụọ ha obere ahụ, mana enweghị onye nwụrụ. 2) Otu Jimeta FC: N'ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị 2009, mmadụ 15 nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Platu steeti. Ụgbọala bu ndị ọgbabọọlụ Jimeta FC na-aga Abụja (ebe ha nwere asọmpi) oge ọ kpọkasịrị n'ụzọ Akwanga. Mmadụ 11 nwụrụ ozugbo, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nwụrụ n'ụlọọgwụ. 3) Otu Rock City Queens: Ụbọchị 21 nke ọnwa Disemba 2008, ụmụnwaanyị ọgbabọọlụ 18 nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Platu steeti. Ụgbọala bu ndị ọgbabọọlụ Rock City Queens na ụgbọala ọzọ kụkọtara isi ọnụ, nwuru ọkụ ma gbuo ndị nọ ya n'ime. Otu onye anwụghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-43409822,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43409822,Innoson azaghị oku ụlọịkpe 'Special Offences' kpọrọ ya.,"Onyeisi ndị ọrụ Innoson Motors bụ Innocent Chukwuma abịaghị ụlọịkpe puruiche akpọrọ Special Offences Court na bekee taa na Ikeja, Lagos steetị.","Onye ọkaịkpe ji okwu ekwuola na ọ wepụla aka ya n'ihe gbasara okwu a A kara na a ga ebido ị kpe ịkpe di n'etiti ya na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara nrụrụaka ego bụ EFCC taa mana ọ pụtaghị Nke a ga-eme ya ugboro atọ Chukwuma nwe Innoson ga-agbachi nkịtị ebe ụlọịkpe na-akpọ ya. Mana Innoson gbara onye okaiwu ji ịkpe ya bụ Jọstis Mojisola Dada akwụkwọ ya sere aka n'ihe gbasara ịkpe ya. Okaịkpe Dada kwuru na ebe Chukwuma kpere ya na aka ndị National Judicial Komision, ọ gaghị eme ihe ọzọ n'ịkpe Innoson rue mgbe ọ zara ndị Kọmishọn ajụjụ . Ụlọịkpa a kpọla Innoson na Jenụwarị 17 n'akwa na Ferbụrụwarị 9 mana ọ zaghị ma kwuo ihe ojighi za. Ihe meburu ochie n'okwu a: Innoson na-arụpụta ụgbọala dị ịcheịche Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53095748,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53095748,Dan Foster: Ihe onye mbụ were ya n'ọrụ na Naijiria na ndị ọzọ ma ya na-ekwu maka ya,"Ọ bụ onye ọbịa na Naijiria maka kemgbe ụbọchị Fraide akụkọ ọnwụ ya pụtara ife, ụmụ Naijiria ọkachasị ndị ma maka Dan Foster ka na-atụ arịrị ọnwụ ya.","Chris Ubosi, onye nwe Beat FM bụ ezigbo enyi Dan Foster Foster bụ olu a ma ama n'ihe gbasara igwe mgbasaozi redio na Naịjiria, nwụrụ ụbọchị Wednezde ka ọ rịachara ahụ nwa oge site n'ọrịa coronavirus. Na nkọwa ụdị mmadụ Dan Foster bụ, Chris Ubosi bụ onye nwe ụlọọrụ 'Beat FM' kọwara na ""ọ bụ ezigbo mmadụ. I nwee nsogbu ọbụla, Dan ga-ewe ya ka nke gị"". Ubosi, onye si na ịbụ onyeisi ya bụrụ ezigbo enyi Dan Foster kọwara na ""Dan bụnụ onye Naijiria. Ị hụkwanụ ya, akwa Naijiria ka ọ na-eyikarị, nri Naijiria ka na-amasị ya."" Ubosi bụ onye mbụ so gbaa Foster ajụjụ ọnụ e jiri wee ya n'ọrụ mbụ ya na Naijiria sị na ""ezigbo onye ọrụ na-arụkarịa ole e ziri ya rụọ."" Gee Ihe Ubosi Kwuru maka Dan Faster. Etu Chris Ubosi si echeta Dan Foster Ihe ndị ọzọ a ma ama na-ekwu maka ya Ihe ise ị maghị maka Dan Foster 1. Dan Foster bụ onye Amerika lụrụ ọrụ na ụlọọrụ mgbasaozi na Amerịka tupu ọ bịa Naijiria. 2. Ebe mbụ ọ lụrụ ọrụ bụ na Ụlọọrụ redio 'Cool FM' 3. O biela na Naijiria afọ 20 ma lụgharịa onye Naijiria Igbo dịka ya na nwunye mbụ ya, mụtara ya otu nwa gbasara. 4. Foster a na-etu 'Big Dawg' lụrụ onye Igbo, nwa ada Enugwu aha ya bụ Lovina, ha mụkọrọ ụmụ abụọ. 5. Ejiji Naijiria na nri ha na-amasị Dan Foster nke ukwu Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49739185,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49739185,"Cashless policy: Ị dọrọ maọbụ wepụ ego n'ọba ego, ị kwụọ ụgwọ",Nke ụmụ Naịjirịa tetekwuru n'ụra nụ bụ na ha ga na-akwụ ụgwọ ma ha tinye maọbụ dọrọ ego n'ụlọakụ.,"Ka mgbe ATM batara na Naijiria, ọdịzịrị ụmụ mmadụ fecha fecha ị dọrọ ego n'ụlọakụ Nke a bụ iwu ụlọakụ kachasị na Naịjirịa bụ 'Central Bank of Nigeria'(CBN) tiri ọhụrụ a . CBN kwuru na ha ga-amalite ime atụmaatu ejighị ego na-agagharị n'ọnwa Maachi nke afọ 2020 na-abịanụ. Ha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha degara ụlọakụ niile dị na Naịjirịa. N'ime akwụkwọ ahụ, ya bụ ụgwọ ga-amalite n'ụbọchị Seputemba iri na asatọ. Onye chọrọ ịdọrọ ego karịrị puku narị ise ga-akwụ ụlọakụ ya pasenti atọ ebe onye chọrọ itinye ego ole ahụ n'ụlọakụ ga-akwụ paseenti atọ. Nke a bụ gbasara akpa ego nke onye. A bịa n' akpa ego nke ụlọọrụ(Corporate account), onye dọrọ ego karịrị naira nde atọ ga-akwụ pasenti ise, nakwa onye chọrọ itinye ego karịrị naira nde atọ Mana ihe ka na-agbagọjụ ndị mmadụ bụ na ọ bụ na naanị steeti ndị a ka a ga-amalite ya bụ atụmaatụ a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka atụmaatụ a n'elu soshal midia @Ayourb kwuru na atụmaatụ a jọgburu onwe ya. @nafeezi kwuru na ndị mmadụ kwado maka mbuli ego mmanụ ụgbọala. Nwaokorobia a na-ekwu ka ndị gbo ga-esi lafere ije a. Mana @agbedere kwuru na atụmaatụ a abụghị ihe ọhụrụ. Steeti ndị ahụ bụ: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara" media-47923349,https://www.bbc.com/igbo/media-47923349,Man United vs West Ham: Man. Utd alaala na nta n'Old Trafford,Chi ndị Manchester United mụ anya taa ebe ha ji nwapem gbalahụ mmeri n'Old Trafford.,"Pogba gbakpuchara goolu ha abụọ Ọ bụrụ na Chi ha enyeghi ha penariti abụọ mere ha ji merie West Ham, aha ha gaara abụ ""Mmeregịnị"". Nke a bụ makana West Ham ekweghi ha kuru ume n'ime nkeji iri itoolu a gbara bọọlụ. Paul Pogba ji ike dimkpa tinye penariti abụọ na mpio na nkeji 19 na nkeji 80, ebe West Ham si n'aka Felipe Anderson dọbiri otu goolu ha nyetenwuru na nkeji 49. Iji gosi ka ya bụ egwu si taa akpụ, otu egwu bọọlụ abụọ ahụ jikwa mpempe akwụkwọ ịdọ aka na ntị otu otu were laa. Mmeri a ebugoola Man Utd n'ogogo ise na tebulu Premier League ugbua. Ihe ndị ọzọ gbatara na Premier League taa: N'asọmpi ndị ọzọ, Tottenham and Bournemouth ji nkata bunye ndị ọbụ ha na ha goolu. Etu a ka egwu siri kwuru n'abalia: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45218396,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45218396,Gọọmenti Legos steeti: Anyị anaghị akpa nkata ọbụla megide Ndigbo,Aka na-achị Legos steeti bụ Akinwunmi Ambode ekwuola na gọọmenti ya anaghị eme ihe ọjọọ ọbụla maọbụ akpa nkata ọjọọ ọbụla megide Ndigbo bi na Legos.,"Ambode na-akọwa uru ụgwọ ala ga a ba Ambode kwuru nke a ụnyaahụ bụ Tọọsde na nzaghachi akụkọ na-akpagharị n'igwe soshal midia ọ kachasị na 'Whatsapp' nke na-ekwu gbasara nkata a na-akpa megide Ndigbo bi na Legos. Content is not available End of Twitter post, 1 Akụkọ ahụ kwuru na Ambode akwụsịla echichi Eze Ndigbo na Legos ma na-akpakwa nkata ọzọ iji mekpaa Ndigbo ahụ. O kwukwara na Legos steeti bụ ala ndị Yoruba na ọ bụghị ebe ndị mgbere ohu biri maọbụ na ọ bụghị ala onye ọbụla. Mana Ambode kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ okwu ụgha na enweghi ebe ọ gbadoro ụkwụ cha cha, nke ndị na-ebugharị ya na enweghi aka ọrụ ma bụkwara ndị omekome. Kọmịshọna na-ahụ maka atụmatụ(Strategy) na steeti ahụ bụ Kehinde Bamigbetan kwuru na akụkọ ahụ ekwughị ebe Gọvanọ Ambode nọ were kwuo ụdị okwu ahụ maọbụ ọgbakọ ebe ọ nọ kwuo ya nke pụtara na o kwughị ya bụ okwu. O kwuru na Ambode kwere nkwa n'ọchịchị bụ nke ga-anabata onye ọbụla agbanyeghị ebe onye si maọbụ onye mmadụ bụ, nkwa ọ na-emezu n'okwu ya. Mana Bamigbetan kwuru na akụkọ ahụ bụ ihe ịkpa ọchị ma kwuo na Ambode ka na-etinye uchu ịhụ n'ọchịchị ya bụ nke mmadụ niile. O kwuru na nkata ndị kpokobara akụkọ ahụ akpụọla afọ n'ala maka na ọ chịtaghị aja. Gọvanọ Ambode kwuru na ya enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chọpụta ebe ya bụ ozi si bido ma jide ndị niile malitere ya ma takwa ha ahụhụ dịrị ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" 44183314,https://www.bbc.com/igbo/44183314,Lee ihe mere n'agbamakwụkwọ Harry na Meghan Markle,"Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka.","Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii. Nwaada a bụkwa onye ji afọ atọ tọ di ya. Ọlụlụ Harry bụ 'Duke of Sussex' ga-eme Meghan 'Duchess of Sussex'. Naanị nne Meghan bụ Doria Ragland bụ onye ezinaụlọ ya bịara agbamakwụkwọ ya Ọkparaeze Williams meere nwanne ya nwoke bụ Harry 'best man' Meghan ji ụmụaka mejuputa 'bridal train' ya kama onwe ụmụagbọghọ na-achịkọta akwa Ọkparaeze Charles bụ onye dudara Meghan n'ebe a ga-ejikọ ya na Harry, bụ ihe nna Meghan kwesịrị ime Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby, jikọrọ ha abụọ ọnụ ma gbaa ha akwụkwọ Ọkparaeze Harry mere ihe a na-atụghị anya oge ọ gbanyere nwunye ya ọla (ndị be eze Briten anaghị agbakarị ọla) Harry mịchara nwunye ya bụ Meghan ọnụ ka ha pụtara n'ebe a kpọrọ West Door nke St George's Chapel dị na Windsor Castle Harry na Meghan ji ụgbọ ịnyịnya akpọrọ Ascot Landau nyapụ n'ebe ha gbara akwụkwọ na Windsor Castle Ezenwaanyị Elizabeth na di ya bụ Ọkparaeze Philip bụ Duke nke Edinburgh anọọla n'ocheeze afọ iri isii na ise (65) Ọkparaeze Charles, nwunye ya bụ Camilla na nne Meghan bụ Doria Ragland ka ha na-apụta n'ụlọụka Ọkparaeze William bụ diọkparanne Harry na nwunye ya bụ Catherine na nwa ha nwoke bụ ọkparaeze George so bịa agbamakwụkwọ a Ụfọdụ ndị echefughị nne Williams na Harry bụ Adaeze Diana nwụrụ n'afọ 1997 David Beckham na-agbabu bọọlụ na nwunye ya bụ Victoria so ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a Serena Williams na-apịa tenis na di ya bụ Alexis Ohanian so ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a Onye ama ama bụ Oprah Winfrey so na ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a Ọtụtụ ndị mmadụ mere njem ịbịa hụ ka Meghan na Harry si agbamakwụkwọ ha pụta Foto niile a si n'aka ndị Getty Images." afirika-43994068,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43994068,Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa,Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari esila njem ọ gara na mba Amerika ị leta onyeisiala Donald Trump nata Naịjirịa.,"Buhari na Trump kpara maka ibuso ndị oyi egwu agha Ụgbọelu bụ ya tụrụ na ụlọụgbọelu onyeisiala nke Nnamdi Azikiwe International Airport,Abuja n'elekere 10 nke abali. Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gara ị nabata ya. Ọ bụ onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ bụ Femi Adesina gwara ndị nta akụkọ nke a ka ụgbọelụ ahụ tụchara n'ala. Buhari onye hapụrụ Washington DC ụbọchị Tusde ka ya na Trump nwechara nzụkọ kwusiri na London. Onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ nke ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu,boro ya bụ nkwụsị nke mberede iji nyocha ụgbọelu kwuru na ọ bụ maka na ugbọelu ndị ukwuu nke onyeisi ji eme njem ka na gabiga ndozi. O kwukwara na Buhari ji obere ugbọelu na-enwechaghi ume ị fe ogogo dị anya eme ya bụ njem, kpatara o jiri kwụsị na ala Britain. Shehu kwuru na nkwụsị ahụ bụ maka ịgbanye mmanụ n'ụgbọelụ ya ma nyocha ụgboelu tupu ọ natawa Naịjirịa. O kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ na bụ nkwụsị maka na onyeisiala anatawala Naịjiria. Mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44446388,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44446388,Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị aga ahịa na Naịjirịa?,Egwuregwu bọọlụ bụ egwuregwu nwere ọtụtụ mmadụ ọ na-amasị na Nịjirịa na kwa n'ụwa niile.,"Super Falcons eburuola iko mba Afrika ugboro iri Ugbua, asọmpị iko mba ụwa bụ nke na-akpọtụ akpọtụ nke ọma makana ọ ga-ebido n'ụbọchị atọ na-abịa, mana ajụjụ anyị na-ajụ n'akụkọ a bụ: gịnị mere egwuregwu bọọlụ gbasara ụmụnwanyị anaghị enwe mmasị dịka o kwesiri ị nwe? Ka anyị leebe anya n'otu Super Falcons. Taa, Super Falcons meriri Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii na asataghị ihe n'agba nke abụọ n'itozu n'isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Super Falcons anaghị irete uru ka ndị Super Eagles Cheta kwa na Falcons ebuliela iko a ugboro iri kamgbe e ji malite emume a. Mana ruo ugbua, ọtụtụ mmadụ anaghị e kiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka a esịrị tụ anya. BBC Igbo jụrụ ndị bọọlụ na-amasị ajụjụ ọnụ gbasara okwu a. Gịnị mere ọtụtụ mmadụ anaghị ekiri bọọlụ ụmụnwaanyị? Chisom Mbonu-Ezeoke bụ nwaanyị egwuregwu bọọlụ na-amasị nke ọma. O kwuru na ọ bụ makana gọọmentị anaghị etinye ego n'egwuregwu a. Super Falcons bụ ndi nọ n'isi egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n'Afrịrịka O kwukwara na ndị ntaakụkọ anaghị agbasa ozi gbasara egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyi ka ha kwesiri ịme. Mana Kenneth Umerue kwuru na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ekiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị makana n'ụche a egwuregwu a bụ nke nwoke. Umerue kwuru na ""Ndị bekee kpọrọ ihe a 'Gender Issues'"". Mana Mbonu-Ezeoke ekwetaghị n'okwu nke a. O kwuru na ""ị lee anya oge ọbụla ndị Super Falcons na-agba agba nke ịkpeazụ, ọgbọ egwuregwu na-eju gbọm!. Nke a gosiri na egwuregwu a na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ"" Stephen Mbonu kwetala na ihe a Mbonu-Ezeoke kwuru, mana ọ dọrọ aka na ntị sị: ""oge eruola ịchọpụta ọtụtụ ụmụnwanyị nwere ike ị gba bọọlụ ọfụma ọfụma. Ihe a ga-eme ka mmasị egwuregwu a na-eto oge ọbụla."" Akụkọ ga-amasi gị:" egwuregwu-49051562,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49051562,AFCON 2019: Senegal alụchaala ọgụ Algeria enwere akụkọ,Goolu Baghdad Bounedjah nyere ngwa ngwa e bidochara boolu (na nkeji abụọ) zuru ibunye Ọljiria Iko Mba Afrịka nke afọ 2019.,"N'asọmpi Iko Mba Afrika a gbara n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị bụ nke ikpeazụ e ji ama mbe abụọ nke bụ oke, Sinigal gbakachara Ọljiria ahụ, mana o zughi inye ha iko ha chọ bịa. Egwu bọọlụ a biri n'otu ọkpụ, dịka Ọljiria butere Iko Mba Afrịka nke abụọ ha. Sadio Mane nke mba Sịnịgal gbara ebibi ụwa iji hụ na ha nyetara goolu, mana otu abụghị n'ezi. Sadio Mane so Liverpool bulie iko Champions League nke afn̄ọ 2018/2019 Dịka o si mee mgbe otu abụọ a zutere n'agba nke ndị otu n'asọmpi a (""Group Stage""), Ọljiria jikwa otu ọkpụ goolu a na-asataghị ihe merikwaa Sịnịgal ọzọ. Ije Ọljiria gara wee ruo agba ikpeazụ Ikpeazụ Ọljiria hụrụ iko a anya tupu ha ebulie ya n'afọ 2019 a, bụ n'afọ 1990; mgbe ahụ amụbeghi onye ndu so ha bịa ije a bụ Riyad Mahrez. A mụrụ Mahrez n'afọ 1991; ka otu afọ Ọljiria ji metụ iko a aka gachara. Lee etu e si gbaa egwuregwu a: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48199009,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48199009,Peter Obi: 'E nweghị m obi nkoropụ ọbụla',"Kepukepu anyị nụrụ maka Peter Obi kwuru na ""obi koropuru ya ma kwuo na ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ"".","Peter Obi tụru ka ọnwa n'ụlọikpe Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'ekwentị ịmata nke bụ eziokwu, Peter Obi kwuru na ọ bụ ya bụ onye ikpeazụ obi nkoropu ga-eme makana ọ ka ga-adị ndụ wee kwuo okwu gbasara ọdịmma Naịjirịa. Gịnị butekwaranụ okwu a? Peter Obi: 'E nweghị m obi nkoropụ ọbụla' Peter Obi kwuru na ọ gwara ndị ya na ya nọ na ọ chọrọ ịga mee nyocha ahụ maka ọrịa ịba, ha asị ya ya gaa obodo oyibo gaa mee ya. O kwuru na ọ ga-aga Onịcha gaa mee ya makana Naịjirịa ka nwere ezigbo ụlọọgwụ ebe mmadụ nwereike ịnata ọgwụgwọ zuru oke. O kwuru na ọ bụ ndị iro ya buuru ya bụ mkparịtaụka gaa tụgharịa ya n'ụzọ ọzọ. Ebee kwanụ ka ị nọ ugbua? Obi kwuru na otebeghị aka ọ wụturu n'ụgbọelu maka njem ịga n'ụlọikpe gere ikpe gbasara ntuliaka 2019 pati ya kpesara n'ụlọikpe. N'elu Twitter, anyị hụrụ foto ndị a gosiri na Peter Obi nọ n'ụlọikpe dịka o si kwuo. Gịnị bụ olileanya gị maka ikpe ntuliaka onyeisiala? Obi gwara BBC Igbo na ọ naghị etinye ọnụ n'ihe ọbụla gbasara ụlọikpe makana ọ ma na ha ga-eme ihe ziri ezi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45055451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45055451,Saraki: Ndị na-akwado APC na PDP etinyeela ọnụ na nsogbu a,Akụkọ nke mere ọhụrụ n'etiti ndọrọndọro ọchịchị Naijiria ụnyaahụ bụ na otu Peoples Democratic Party (PDP) ahọpụtala onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dịka onyeisi ha.,"Saraki meriri EFCC n'ụlọikpe kachasị n'ọnwa Juli maka ebubo mpu na nruru aka Mana ụnyaahụ, akụkọ kwuru na PDP ziri ozi ka ndị omeiwu ha niile laghachite Abuja, maka ha na-eche na APC nwere ike ijiri ike mepe ụlọomeiwu wee chutuo Saraki na Ekweremadu. BBC Igbo gbara ndị otu APC na PDC ajụjụọnụ maka ebumnuche ha gbasara ihe a na-eme ugbua n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa. Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu APC na Legos steeti gwara onye ntaakụkọ anyị na nsogbu PDP bụ na obi na-amapụ ha maka njọ niile ha mere n'ala Naịjirịa. N'ọnụ okwu ya,""Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari abụghị onye na-eji njọ akwụghachị njọ. PDP na-ama jiji maka na obi ha na-apịa ha ụtarị maka mpu na aghụghọ niile mere n'oge ọchichị ha."" Igbokwe kwusiri ike na ọ bụ ikike ndị Sineit ịhọpụta ndị ha chọrọ ka ha chịa ha. ""Ọ bụrụ na ha chọrọ ịchụda Bukola Saraki, o nweghị njọ dị na ya."" Mana Austin Umehi bụ otu n'ime ndị welitere isi na PDP kwuru na APC agaghị anwa anwa ịchụda Bukola Saraki. PDP na-ebo na aka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nọrọ na nsogbu a O kwuru na: ""Ụlọomeiwu nwere iwu ha na-eso. Ihe a pụtara na ndị otu APC agaghị eteta n'ụra otu ụbọchị, chụda mmadụ dịka Bukola Saraki."" O kwukwara na o nweghị egwu dị n'obi Saraki maka ya, nakwa na ndị ụlọomeiwu na-eche echiche a na-egbu oge ha. Etu ọ dị ugbua PDP sị na Saraki bụ onye otu ha kachasị elu n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa, nke mere ha jiri tunye ya ugo a. Dịka o siri dị ugbua, nke ga-abụ mbụ pati na anọghị n'ọchịchị, maọbụ nwekarịa ndị omeiwu, ga-achi ụlọomeiwu na Naịjirịa. Mana, a mabeghị ma ọnọdụ a ọ ka ga-adị etu a, maka na n'ụbọchị 24 nke ọnwa APC wepụtara aha ndị omeiwu 52 ha si bụ ndi otu ha, nke nyere ha nkarị n'ụlọomeiwu. Ya bụrụ na nke a bụ eziokwu (o nwebeghị ndị n'ime ndị a gọnahụru edemede a) APC nwere ọnụgụgụ a ga-eji chụtuo Saraki ma ndị omeiwu laghachite ezumike. Ekweremadu ka-aza ajụjụ n'aka ndị EFCC Nke mekwara ụfọdụ ndị omeiwu nke obele jiri nọdụ n'ụlọomeiwu ụnyaahụ. Akụkọ kwukwara na ndị sinetọ otu PDP ga-enwe ọgbakọ ebe ha ga-eche ihe a ga-eme ma ọbụrụ na APC mere udi ihe a. Ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ Sun dere na ndị Sinetọ gara njem n'ala Bekee ga-alaghachị azụ taa maọbụ echi. Chukwuka Onyema bụ osote onyeisi otu PDP n'ụlọ omeiwu obele gwara ndị ntaakụkọ na ha nụrụ akụkọ ndị sinetọ otu APC ga-emee ọgbakọ na nzuzo ịchụda Bukola Saraki. PDP na-ebokwa na njem Buhari gara ala Briten bu maka inyere ndị sinetọ APC ohere ịchụda Bukola Saraki. Asị, asị! Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjịria bụ Garba Shehu bụ na-ebubo nke a gbasara Buhari bụ asị na-atọ ọchị maka na o nweghị onye ọbụla na Naịjirịa ga-ekwenye n'ihe ọbụla PDP ga-ekwu ọzọ n'ala a. Akukọ ga-amasi gị" afirika-48384830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48384830,Akwaeke Emezi: 'Ọgbanje' Igbo ji eme ọnụ,Akwaeke Emezi bụ nwaafọ Igbo emetela ihe ndị mmadụ ji kpụrụ ya n'ọnụ na mbaụwa.,"Ị na-ajụ ihe o mere? BBC Igbo ga-aza gị. Emezi sị na ọ bụ ""Ndị"" (n'ihi na ọ bụghị nwoke maọbụ nwaanyị) toro n'Aba dị n'Abịa steeti, dere akwụkwọ ndị bekee chọrọ iji mee ihe ejije bụ nke a na-akpọ ""film"" na bekee. O biputara ya bụ akwụkwọ wuru ewu, nke a kpọrọ ""fresh water"" n'afọ 2018; otu afọ ka o nwetachara nturuugo n'asọmpi edemede nke Common Wealth e mere n'afọ 2017. End of Instagram post, 1 Iji gosi gị na Igbo nwere mmadụ, Emezi sozi ndị odeakwụkwọ e ji ama atụ dịka Flora Nwapa, Chimamanda Adichie, Buchi Emecheta wdgz. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52458111,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52458111,Kano Deaths: Ọnwụ amaghị ebe o si na Kano na-agba anyị gharị - Ndị Igbo bi na Kano,Ọtụtụ ndị Ọwụwa Anyanwụ bi na Kano ekwuola na akụkọ ọnwụ na-akpọtụ na steeti ahụ emetụghị ha.,"Ndị na-eli ozu kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'izuụka gara aga Kano steeti so n'obodo kachasị n'Ugwu-Awụsa dịka ọnụgụgụ mmadụ bi na ya, gụnyere ọtụtụ ụmụ Igbo, ruru nde iri na ise mana akụkọ na-agba anyamiri na-ewu na nsonso a bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ na steeti ahụ n'oge a n'ihi ọrịa amaghị ebe o si. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo ya coronavirus mana gọọmentị steeti ahụ sị na ha enweghị ike ịkọwa ihe butere ya bụ ọnwụ mberede dịka ha rụtụrụ aka na o nwere ike bụ ọrịa shuga, ọbara mgbanielu na ịba. Ndịsi ọwụwa anyanwụ bi na Kano ha na BBC Igbo kpara sị na ya bụ ọnwụ na-egbu ka ọkụkọ bụ n'akụkọ ka ha na-anụ ya. Mazi Romanus Okoro bụ onye birila na Sabon-Gari dị na Kano karịa afọ iri atọ sị na ha na-anụ ya bụ akụkọ na redio nakwa onyonyo TV. O kwuru sị: ""O nweghị ka ya bụ ihe si metụta anyị."" N'otu aka ahụ, nwaafọ Igbo ọzọ bikwa na Kano bụ Nduka Abili sị na ""o metụtaghị anyị. Ọ bụ ndị Ugwu ka ọ na-egbu."" Okoro kwuru na ya che na ihe ga-eso bute ya bụ ọrịa bụ ka ndị Ugwu si arụ ụlọ nke ezigbo ikuku anaghị abata na ya. O kwuru sị: ""Ụdị ekpomọkụ dị na Kano ugbua nwere ike igbu mmadụ"". O kwukwara na ya bụ ọnwụ ka njọ n'ime obodo bụ ebe tere aka site n'ebe ha bi. Abili gara n'ihu kwuo na ọrịa ahụ na-egbu ma ogbenye ma ọgaranya ọkachasị ndị afọ ha gbalịiterela. Ọ kọwakwara na ọtụtụ ụlọọgwu abụghị nke gọọmentị anaghị anabata onye bu mkpesa ịba maọbụ ahụọkụ n'ihi egwu coronavirus. ""Nke a na-eme ka ndị nwere ọrịa alaa, ha aṅụwara onwe ha ọgwụ, ụfọdụ ọnọdụ ha akawanye njọ, ha esi na ya nwụọ"", Abili na-ekwu. Gọvanọ Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje arịọla gọọmentị etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka Mgbe BBC jụrụ ndị ọrụ ahuike na Kano, Onyeisi otu jikọrọ ndị dọkịta bụ 'Nigeria Medical Association' na steeti ahụ bụ Sanusi Mohammed Bala kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu chaachaa. Bala sị na ihe mere o ji dị ka ndị dọkịta anaghị anọ bụ maka usoro ha weputaara ha ji arụ ọrụ maka ịchekwa onwe ha maka ya bụ ọrịa. Bala sị na ""onye ọbụla na-akpachapụ anya ya ugbua"". Cheta na Gọvanọ Abdullahi Ganduje kpọchichara Kano steeti ịzụụka abụọ gara aga mgbe ọrịa covid-19 malitere ịrị ibe ya elu. Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa gọọmentị kano machiri ngagharị kpam kpam na steeti ahụ ruo izuụka abụọ Onye Ugwu ọzọ anyị gbara ajụjụ ọnụ bụ nke na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya bụ onye bi na Ida dị na Kano steeti sị na ya bụ ọnwụ mberede malitere n'izuuka mbụ mkpọchi a bidoro. Ọ na-eche na o nwere ike ịbụ agụụ, ihe isiike na obi mmapụ butere ya bụ ọnwụ ọkachasị ebe ụfọdụ na-eche ihe ha na ezinaụlọ ha ga-eri dịka mmachi ngaghari biara ha na mberede. Ọ sị na o nwekwara ike ịbụ na ahụ adịghị ọtụtụ n'ime ndị ahụ gbabiiri nwụọ maka na ọtụtụ n'ime ndị a dị n'agbata afọ iri ise na iri isii. Ọ sịkwa na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ naani n'ime obodo ka ya bụ ọnwụ dị, ""a ma m mmadụ abụọ ndị o gburu n'Ida ebe a""." egwuregwu-50158928,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50158928,Europa League fixtures: Chi Pepe azọọla ndị Arsenal na ndagwurugwu ọnwụ,"Nicolas Pepe bụ onye ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ọjọo maka ihe ọ gbara na Premier League oge Arsenal zutere Sheffield United na ngwụcha izu a, abụrụla onye zọrọ ha.","Goolu abụọ o nyere na nkeji 80 na 90, mere ka ọnwụ niile ndị Vitoria de Guimaraes na-eshi dị ka ebe e ji mmiri oyi wụnyụọ ọkụ. Marcus Edwards nke Vitoria de Guimaraes bu ụzọ sekpuwe Arsenal ala ka ha gbanyere goolu na nkeji asatọ e ji malite egwuregwu a n'ọgbọegwuregwu Emirates. Tupu Gabriel Martinelli asatara ndị Arsenal nke ha na nkeji 32 iji wepụ ha ihere n'ihu. Mana na-emeghị eme, Bruno Duarte gbakanyekwara goolu ọzọ na nkeji 36, iji gosi Arsenal na ha abụghịkwa mmọnwụ a na-akwa aka. Ọtụtụ ndị che na nke Arsenal na-eme agwụla oge e ruwere nkeji 80 mana ha asatabeghi goolu, mana Pepe e webatara n'ime nkeji 75 bịara zaa aha nna ya ma gbaa aka ahịa n'ime nkeji ahụ. Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezutekwa Vitoria n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, mana ọ ga-abụ na be ha nke ugbua. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45431597,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45431597,Ị ma na iwu Naịjirịa machiri nwaanyị ịrụ ọrụ n'abalị?,"N'ime afọ ole na ole ugbua, anya ụmụnwaanyị ebidola imepe ebe ịmata ikike dịrị ha n'iwu Naịjirịa nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ha dị.","N'agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnwaanyị kwenyere n'ihe a kpọrọ 'feminist movement', e nwere ụfọdụ iwu dị na Naịjirịa bụ ọgbatughie nye ya. Nnanna Emeka bụ onye ọkaiwu, so n'otu ndị bu okwu femịnisti a n'isi na Naịjirịa makana ọ gụrụ 'Feminist Jurisprudence' na mahadum. O kwuru na ọ na-awụ ya akpataoyi ịhụ ndị na-aghọtaghị na e nwere ụfọdụ iwu na-ekpuchiteghị ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Lee ihe ndị o dere na soshal midia gbasara iwu ndị ahụ: 1. Nwoke nwere ike iti nwunye ya ihe N'okpuru ọkara 55 (d) nke 'Nigeria Penal Code' nke metụtara di na nwunye lụrụ n'okpuru iwu omenala, nwoke nwere ike iti nwunye ya ihe ka ụmụaka ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị emerụ ya ahụ ga-ebuga ya ụlọọgwụ. N'agbanyeghị na iwu a ka dị rue ugbua, Naịjirịa wepụtara iwu a kpọrọ 'Violence Against Persons Prohibition Act' n'afọ 2015. Iwu a megidere ụdịrị mwakpo dị iche iche; onye dara ya nwere ike inweta ntaramahụhụ tara akpụ. 2. Nwaanyị ekwesịghị ịrụ ọrụ n'abalị Ọkara 55 nke iwu 'Nigerian Labour Act' anaghị ekwe ụmụnwaanyị rụọ ọrụ n'abalị belụsọ na ọ bụ nọọsụ. Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agba akwụna n'abalị na Naịjirịa Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahụta ya na iwu a ga-eme ka ụmụnwaanyị ghara ịkpata ego etu kwesịrị ekwesị, mana Olamide Abe na-agụ maka iwu na mahadum, gwara BBC na iwu na-ekpuchite ụmụnwaanyị. O kwuru na etighị iwu a ka e megide ụmụnwaanyị. 3. Iwakpo ụmụnwaanyị n'ike abụghị nnukwu mmehie N'ime ọkara 353 nke iwu 'Nigerian Criminal Code', iwakpo nwoke ọbụla bụ ezigbote mpụ, e nwere ike ịtụ gị mkpọrọ afọ atọ. Mana n'okpuru iwu a, iwakpo nwaanyị n'ike abụghị nnukwu mpụ, ntaramahụhụ ya akarịghị ịnọ afọ abụọ n'ụlọmkpọrọ. 4. Nwoke mba ọzọ enweghị ike ịbụ onye Naịjirịa site n'ịlụ nwaanyị Naịjirịa Nwaanyị si mba ọzọ nwere ike ịbụ onye Naịjirịa site n'ịlụ nwoke Naịjirịa N'okpuru ọkara 26 na 27 n'iwu Naịjirịa, naanị nwoke nwere ike isi n'alụmdinanwunye mee onye mba ọzọ onye Naịjirịa, nwaanyị enweghị ike ịnwa ya anwa. 5. Nwaanyị ekwesịghị ike nwa ya di maọbụ nwaanyị Onye ọbụla na-erughị afọ 21 chọrọ ịbanye n'alụmdinanwunye ga-anata akwụkwọ ikike n'aka nna ya. Naanị ihe ga-eme ka nwaanyị dee akwụkwọ ikike ahụ bụ ma ọ bụrụ na di ya anwụọla maọbụ ọ bụrụ na isi mgbaka na-eme ya. Iwu a dị n'okpuru ọkara 'Nigerian Marriage Act'. 6. Ọ bụghị njọ ma nwoke wakpoo nwunye ya n'ike Ọkara nke isii nke 'Nigerian Criminal Code' na-akọwa na iwakpo nwaanyị ị lụrụ alụ abụghị mpụ. Dịka iwu a si kwuo, enweghị etu nwoke si awakpo nwunye ya n'ike maọbụ nwaanyị si awakpo di ya n'ike. Olamide Abe kwuru sị na iwu a adịghị mma makana ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụshi anya maka mwakpo ndị ha lụrụ na-eme ha. Dịka ndị feministi ndị ọzọ, Nnanna chọrọ ka e tinye iwu ga-ekpuchite ma nwoke ma nwaanyị, ma tinye uchu ịhụ na ndị mmadụ mere iwu ahụ. Eunice Atuejide Feminist. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44725339,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44725339,Ụlọikpe akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere n'Imo steeti.,"Ụlọikpe ukwu nọ n'Owere, isiobodo Imo steeti akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere na steeti ahụ.","Rochas Okorocha na ndị pati APC na-akwata n'Imo steeti Ọkaikpe Lewis Allagoa nyere iwu ka e megharia ya. N'ikpe ya, Ọkaikpe ahụ kwuru na mkparitaụka Okorocha na ndị ntaakụkọ nwere nakwa ihe Inec kwuru, APC eweghị ntuliaka imeụlọ n'abalị ise nke ọnwa Mee. Ọ gwara APC ka ọ gbaa mbọ chekwa ọchịchị onyekwuoucheya site na i megharị ntuliaka ọhụrụ na steeti ahụ. Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Rọchas Okorocha bụ Sam Onwuemedo nwere n'ekwenti, o kwuru na mkpebi ahụ bụ eziokwu. ""Akụkọ ahụ bụ eziokwu. Ụloikpe akagbuola ya ma nye iwu ka e megharịa ya. N'ezie emeghị ntuliaka ọbụla n'Imo steeti."" Cheta na otu nkewa APC na steeti ahụ ndị kwụnyere Okorocha gbara akwụkwọ n'ụlọikpe rịọ ya ka o kpebie na ntuliaka akwadoburu ime n'ọnwa Mee 5, afọ 2018, na akụghị ya isi n'ihi na o nweghị mpụtara ọbụla. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55336663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55336663,Gọọmentị ga-akwado ezinụlọ onye ndị uweojii gbagburu n'Igboukwu - Willie Obiano,"Gọọmentị Anambara steeti ekwela nkwa ịkwado ezinụlọ Ebere Nwogba, bụ onye ahụ ndị uweojii gbagburu n'Igboukwu n'abalị Tuesday.","Gọvanọ Willie Obiano kwere nkwa a n'ụbọchị Tọzde oge ndị ntaakụkọ steeti ahụ gbara ya ajụjụọnụ. O kwuru na gọọmentị ga-enye ezinụlọ Nwogba nkasị obi niile dị ha mkpa dịka ego nakwa enyemaka ndị ọzọ. Obiano katọrọ ya bụ ihe merenụ ma kwuo na aka akparala onyeuweojii kpara arụ ahụ. Kama ọ gakwara n'ihu katọọ ndị ntorobịa gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ. O kwuru sị: ""Ịgba ụlọ ndị uweojii nakwa ụgbọala dị icheiche ọkụ, agaghị eme ka ihe niile dajụọ"" Etu ogbugbu onye okada si bute ọgbaaghara n'Igboukwu, Ekwulobia, Oko Obodo Igboukwu, Ekwulobia nakwa Oko nke dị n'Anambara steeti nọ n'ọgbaaghara n'ụbọchị Wenezde a n'ihi ebubo aka ike ndị uweojii. Ndị ntorobịa e jirila iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii atọ ọkụ n'obodo ndị a n'ihi ogbugbu otu onye ọkada. Otu onye Igboukwu hụrụ ihe niile merenụ kọọrọ BBC Igbo na ọ bụ ogbugbu ndị uweojii gburu otu onye okada kpatara ngagharịiwe ahụ. Ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Igboukwu nke ndị ntorobịa mụnyere ọkụ Nwoke achọghị ka ekwuo aha ya kwuru sị: ""Ya bụ ihe malitere n'abalị ụbọchị Tuzde oge ndị uweojii nwuchiri otu onye ọgbatumtum"" ""Ha kwuru na iwu obodo machiri mmadụ ịgba ọgbatumtum ma elekere itoolu nke abalị kụchaa."" ""Mana oge ha kpụ nwoke ahụ aga, ha zutekwara onye ọkada ọzọ mana onye nke ahụ ekweghị ahapụrụ ha ọgbatumtum ya."" ""Oge ha na onye ahụ na-agbarị, onye nke mbụ ha jidere buuru ọgbatumtum ya gbalaga."" Ụgbọala dị n'ogige ndị uweojii nke a gbara ọkụ Nwoke ahụ gara n'ihu kwuo na dịka ndị uweojii na onye ọkada ahụ na-ekwu okwu, ndị mmadụ malitere ịgbakọ nke mere ndị uweojii ji malite ịgba egbe iji chụsaa ndị mmadụ. Mgbọ tụrụ onye ọkada ahụ - aha ya bụ Ebere Nwogba- n'afọ, mana ndị uweojii hapụrụ ya ebe ahụ, buru ọgbatumtum ya n'ụgbọala ha gbalaga. Ọ bụ mgbe chi foro ka ndị mmadụ hụrụ ozu onye ọkada ahụ, nke mere ha ji malite ngagharịiwe. Ụfọdụ akụkọ kwuru na nwunye nwokorobịa ahụ ndị uweojii gbagburu, ka mụrụ nwa ọhụrụ n'ọnwa abụọ gara aga. Nwaokorobịa na-akwadokwa olili nna ya onye nke nwụrụ n'ọdị nso a. 'Anyị achọghị ndị SARS na Fegge'- Onye uweojii Rabiu Garba Dịka nwoke ahụ sị kwụọ, ndị ntorobịa ji iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Igboukwu ọkụ. Ha mekwara ngagharịiwe gaa Ekwulobia, ebe ndị uweojii malitekwara ịgbali egbe elu. Ogige ndị uweojii Ekwulobia Egbe ahụ tụkwara mmadụ abụọ ọzọ, nke mere ndị ntorobịa ji gbaa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ekwulobia nakwa nke dị n'Oko ọkụ. Ihe ndị uweojii kwuru Onyeisi ndị uweojii n'Anambara steeti bụ John Abang Onyeisi ndị uweojii Anambara steeti bụị John Abang kwuru na ha anwuchiela ndị uweojii aka ha dị n'ọnwụ nwaamadi ahụ bụ Ebere Nwogba. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed kwuru na ya bụ ihe dị nnukwu mwute. Mohammed kwukwara na nnyocha miri emi amalitela maka ihe a merenụ, ma kwe nkwa na eziokwu ga-apụta ihe n'oge adịghị anya." afirika-49677883,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49677883,Etu ọnwụ di maọbụ nwunye nwere ike isi butere onye nke dị ndụ oke agụụ,"Di mmadụ ịnwụ bụ ihe oke mgbawa obi, mana otụtụ omenala na mba dị icheiche n'ụwa na-eme ka ahụhụ ụmụnwaanyị di ha nwụrụ kawanye njọ - tụmadị ma a bịa n'ihe oriri.","Onye ntaakụkọ BBC bụ Emily Thomas kọwara na ụfọdụ omenala anaghị ekwe ụmụnwaanyị di ha nwụrụ anwụ rie nri mgbe ha chọrọ. Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ Ụfọdụ na-egbochi ha iri nri ndị na-edozi ahụ, ebe ndị ọzọ na-enye ha ihe nwere ike imekpa ahụike ha ahụ ka ha rie. Iji maa atụ, na mba Gana, e nwere omenala na-amanye nwaanyị di ya nwụrụ ka o rie ofe e ji akụkụ ahụ di ya nwụrụ anwụ sie. Ihe dị ka ntutu isi maọbụ mbọaka onye nwụrụ anwụ ka a na-ewere tinye n'ofe bịa manye nwunye onye ahụ ka o rie ya. Mgbe ụfọdụ a na-ewere mmiri e ji saa onye nwụrụ anwụ ahụ bunye nwunye onye ahụ ka ọ ṅụọ Fati Abdulai, onyeisi otu a kpọrọ ""Widows and Orphans Movement"" nke dị na Gana kwuru na mgbe ụfọdụ, ""a na-asa onye nwụrụ anwụ ahụ, bịa were mmiri ahụ gwakọọ n'ihe ndị ọzọ, nye nwunye onye ahụ ka ọ ṅụọ"". Ọ na-abụkarị ụmụnwaanyị dara ogbenye ka a na-eme ụdị ihe a. Ndị bara ọgaranya anaghị anata ụdị mmegbu a. N'omenala ụfọdụ, nwaanyị di ya nwụrụ anaghị eketa akụnụba ya ma ọ bụrụ na ọ lụghị otu n'ime nwanne di ya. Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ Nke a pụtara na ọtụtụ ụmụnwanyị isimkpe na-adakarị ogbenye. A na-eche na ihe ruru ụmụnwanyị nde 285 bụ ndị isimkpe n'ụwa niile. A na-echekwa na otu n'ime ụmụnwanyị iri ndị isimkpe bụ ndị dara oke ụbịam. ""Ndị isimkpe anaghị eri azụ, anụ maọbụ akwa"" Nne Chitrita Banger Gee bụ Anita Banerjee na nne nne ya bụ Prabhabati Mukerjee Na mba ụfọdụ n'ụwa, mmekpa ahụ ụmụnwanyị isimkpe ka na-aga n'ihu ruo taa. Na mba India, ụmụnwaanyị ndị di ha nwuru anaghị eri azụ, anụ, akwa, yabaasị nakwa ""garlic"". Chitrita Banger Gee, onye ọkacha mara na nri na-edozi ahụ n'obodo Bengali, India, kwuru na ihe dị otu a jọgburu onwe ya. ""Ọ dịzi ka a ga-asị na ọ bụ nwaanyị ji aka ya kpatara onwe ya ọnwụ di ya, nke mere e ji ata ya ahụhụ"". Gee kwuru na mgbe papa nnukwu ya nwụrụ, mama nnukwu ya husiri anya. ""Ọ gbanwere n'otu ntabi anya. Ọ kwụsịrị iyi akwa mara mma, yibezịe naanị akwa ọcha."" ""Ọ kwụsịrị iso mmadụ niile erikọ nri maka na ọ bụghịzi ihe niile ka o nwere ike iri."" ""Mana n'ihi na ọ ma ka e si esi nri nke ọma, ọ na-eji ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ anọchi anya ihe ndị ahụ a machiri ya iri."" Ihe nchọpụta gosiri Nwanyị na-elepu anya na windo Nchọpụta e mere na mba Chaịna, Yurop nakwa Amerịka gosiri na ndị di ha nwụrụ anaghị eri ezigbo nri na-edozi ahụ. Elisabeth Vesnaver, onye nchọpụta gbasara nri na-edozi ahụ, mere nchọpụta miri emi gbasara nri ụmụnwaanyị di ha nwụrụ na mba Canada, tụmadị ndị gbara afọ iri asa maọbụ karịa. Vesnaver kwuru sị: ""E nwere m mama nnukwu abụọ n'akụkụ nke nne m nakwa nke nna m."" ""Otu n'ime ha nwụrụ ka ọ mechara afọ abụọ di ya ji nwụo."" ""Ihe gburu ya bụ anaghị eri nri nke ọma n'ihi na mgbe di ya na-arịa ọrịa, ọ naghị eri nri nke ọma."" Gịnị jikọrị ọnwụ di maọbụ nwunye na nri? Dika nnyocha Vesnaver si gosi, ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ, nwere ike ịnwụ n'ime afọ abụọ ma ọ bụrụ na a kpachapụghị anya. Vesnaver kwenyere na ọ bụ anaghị eri ezigbo nri na-akpata nke a. O kwuru sị: ""Nnyocha gwara anyị n'ezie na a na-enwe mgbanwe n'otu ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ si eri nri."" ""Ha anaghị erizi nri nke ọma. Ha na-ata ahụ. Enweghịkwa ihe na-atọ ha ụtọ."" Michael Freedland with his wife Sara on their wedding day and on their 50th anniversary Onye ntaakụkọ aha ya bụ Michael Freedland na nwunye ya bụ Sara biri afọ 52. Mgbe nwunye ya nwụrụ n'afọ isii gara aga, iri nri bidoro hịawa ya ahụ. N'okwu ya, ""Iri nri n'ụlọ anaghịkwa enye m aṅụrị ma ncha. Naanị obere nri ka m na-eri"" ""Mana e mechara m mụta ka e si eghe akwa nke ọma."" Freedland malitere tawa ahụ. Ihe niile o mere iji buo ibu amịtaghị mkpụrụ. E mechaa, ụmụ ya manyere ya ka ọ mụọ etu e si esi nri mgbe ọ gbarala afọ iri asatọ. ""Nke a bụ ihe pụrụ iche na ndụ m, ọ gbanwere ndụ m nke ukwuu."" Ya bụ, ị chọọ ihe ị ga-emere onye di ya maọbụ nwunye ya nwụrụ, i siere onye dị otu ahụ nri, maọbụ ịkpọ ya ka o soro gị rie nri bụ nnukwu ihe ọma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ" afirika-46300319,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46300319,Boko Haram: Ndị chegharịrị abụrụla ndị ahapụru ka ha banye obodo,Akụkọ dị mkpa: Gọọmenti Naịjirịa ga-atụhapu ndi Boko Haram,"Ọtụtụ ndi Boko Haram si na ha achọghịzị ịnụ ọgụụ Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ndị Boko Haram karịrị mmadụ otu nari na iri ise ga-enwere onwe ha ka a ""sachachara ha ajọ ihe niile dị ha n'isi"". Ndị a mere ihe Bekee kpọrọ ""de-radicalisation programme"" nke ha nọ n'ime ya ruo ọnwa iri na otu na Gombe steeti. Gọọmentị Naịjirịa agbagharala ndị Boko Haram a, ka ha n'owe ha kwere nkwa na ha echeghariala Njem nyocha ọrụ gọọmenti n'ọwụwa anyanwụ ka na-aga n'ihu Ndị Komịti na-ahụ maka ọrụ kwuburu na obi adighị ha mma ka ha gachara ụzọ Enugwu-ọnịcha ụnyaahụ Ndị omeiwu na-etinye anya n'ọrụ ka nọkwa njem nyocha ọrụ gọọmentị na-arụ na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Cheta na ha gara gbaa anya n'ụzọ si Enugwu gawa Ọnịcha na Akwa Naịja nke abụọ ụnyaahụ. Taata ha gara lete ụzọ n'Isiagu nke dị n'Ebonyi steeti nakwa Nnenwe dị n'Enugwu steeti. N'Ofesi Ndi nụrụ agha eji napụ ndiọcha ọchịchi na Zimbabwe nọ n'isi inara ndị ọcha ala Mba Zimbabwe ekwerela na ọ ga ewezụga dọla nde itoolu na iri asaatọ na itoolu maka ịji ticha ndị ọcha anara ala n'ike na mba ahu obi. Cheta na n'ime ọchịchị onyeisiala Robert Mugabe ndị mmadụ chụpụrụ ụfọdụ ndị ọcha n'ụgbọ ha makana ha sị na ọ bụbụ ala nna ha a nara ha n'ike. N'Egwuregwu Mikel bụ onye ndụ ndi Super Eagles ugbua Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na Mikel Obi ka nwere ohere ịsọrọ Naịjirịa mpị na iko mba Afrịka nke 2019. Cheta na Mikel esoghi n'ime ndị sọọrọ mpị na Sawt Afrika eji chụta nta ịga Iko mba Afrika ahụ. N'egwuregwu, Otu Super Falcons menyere ndị Naịjirịa obi aṅụrị ka ha ji ọkpụ goolu anọ merie Zambia oge ha zutere n'asọmpi Iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Fransisca Ordega nwetara ihe nrite ""onye kachasị gbaa"" n'egwuregwu ahụ. Mmeri a bụ nke mbụ Ndị ""Falcons"" na-enweta n'asọmpi a dịka Ghana meriri ha na nke mbụ ha gbara. Ebe Didier Drogba gbabuuru Ivory Coast nakwa Chelsea na Galatasaray bọọlụ awụsala ọwa kpam kpam n'egwu ọ gbara afọ iri abụọ. Didier Drogba buliri iko Premier League anọ, iko FA anọ, Iko League atọ na otu iko Champions League oge ọ nọ Chelsea Ihe Uche Nwosu kwuru Onye na-ele anya ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Uche Nwosu, kwuru na ọ bụ ndị ụlọikpe Naịjirịa ka ọ dị n'aka ikwu onye ga-anọchite anya APC. Uche Nwosu kwuru na ọ bụ ya ka ga-anọchite anya APC n'Imo steeti O kwukwara na tupu e ruo ngwụcha Nọvemba mgbe a ga-amalite ịchụ nta vootu n'ime obodo, na ha ga-ama ihe iwu obodo ga-ekwu maka onye ga- anọchite anya APC Imo steeti. Amaechi bịa zara ọnụ ya Ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa akpọọla minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara ụzọ ụgbọ oloko dị n'Enugwu na Pọt Hakọt. Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu kwuru ka Amaechi bịa kọwaara ha atụmatụ gọọmentị etiti nwere maka ịrụ ya bụ ụzọ ha kwere na nkwa. Na mba ofesi, James Mattis bụ odeakwụkwọ na-ahụ maka nchekwa ndị mba Amerịka, ekwuola na ndị agha uweojii ezipụrụ ka ha na-echekwa oke ala jikọrọ ha na Mekziko agaghị ebu egbe maọbụ ngwaagha ọbụla. O kwukwara na ha agahị enwekwa ikike ịnwụchi mmadụ, na ọrụ ha bụ ikpuchite ndị na-arụ n'oke ala ahụ ka ihe ọjọọ ghara ime ha. Gere akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Sadio Mane na-agbara Liverpool bọọlụ, dị afọ iri abụọ na isii, gbakwara asọmpi niile Senegal gbara n'Iko Mbaụwa. BBC African Footballer of the Year 2018: Mane so na ndị a họrọ" afirika-47716527,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47716527,Brexit: Theresa May eriela mbombo ọsọ?,"O kwuru n'ụlọomeiwu n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Machi na ọ bụrụ na ndị omeiwu ibe ya kwado ya, ọ ga-arịtu n'ọkwa ya.","May sị na ọ ma na ndị ibe ya achọghị ka o soro na-edu ndọrọndọrọ okwu Brexit, ma kwuo na ọ ga-apụrụ ha n'ụzọ. ""A dị m njikere ịhapụ ọrụ a maọbụrụ na ihe ga-adịrị obodo anyị mma"" ka o kwuru. Ụlọikpe pụrụiche e hibere maka ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala 2019 enyela Atiku Abubakar ohere ịkpesa mpụtara ntuliaka ahụ. Atiku Abubakar kwụsịike na-ekwu na wuru wuru nakwa aka azụ dị icheiche ka APC jiri merie ya bụ ntuliaka. Ọkaikpe atọ n'ụlọikpe pụrụiche ahụ kwenyere n'okwu ọkaiwu nọchitere anya Atiku bụ Chris Uche gbasara ikpe ahụ. Na nchọpụta ndị otu Atiku mere na akụrụngwa Inec jiri me ntuliaka ahụ, ha kwuru na Atiku jiri vootu karịrị nde 1.6 merie Muhammadu Buhari. Ọgbakọ EU amalitela asọmpị ndị na-efe ala nna ha Ha kọwara site n'akara Twita ha na ihe ndị ha chọrọ ịnye bụ iji kelee ndị na-efe ala nna ha maka mbọ ha gbara na ntuliaka gara aga. N'egwuregwu, Gọvanọ delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ekwela nkwa na ọ ga-ebunye ndị egwuregwu super eagles puku dọlla iri isii. Ego ahụ ga-abụ iji kelee ha maka mmeri ha meriri mba Seychelles nakwa mba Ijipt mgbe ha zutere onwe ha n'asọmpị. Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Anu enwe apụọla n'efere nrị na Akwa Ibom Enwe apụọla n'efere nri na Akwa Ibom Anụ enwe ga-abụzzị ahịa iwu na Akwa Ibom steeti ka gọọmentị steeti ahu na-ekwu na ekwesiri ịgba mbọ hụ na enwe akpọrọ Adiaha Awa Itam na anazi ana ka echekwa ya maka echi. Gọọmentị na ndị Akwa Ibom mere okpotokpo nzukọ ụnyaahụ bụ ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachị iji tinye ọnu n'ihe metụtara ya bụ enwe. Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Inec sị APC Zamfara dere duu Ụlọikpe mkpegharị nọ na Sokoto steeti, nke Okaikpe Tom Yakubu tukwu n'isi ya, ewezụgala mkpebi Ụlọikpe Zamfara nyere maka ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress (APC) mere n'afọ 2018 iji họpụta ndị zọrọ ha ọchịchị dị icheiche na ntuliaka 2019. Eji ntuliaka a hopụta ndị na-azọ ọkwa gọvanọ, ụlọ Omeiwu steeti nakwa nke gọọmentị etiti. Ọ bụ Omeiwu Kabiru Marafa - bụ onye na-ahụ maka ihe banyere manụ agbịdị n'ụlọ omeiwu naịjirịa - kpupụrụ APC ụlọikpe ahụ. Marafa gara Ụlọikpe Mkpegharị ịrịọ arịrọ ka akagbuo ikpe mmasi ahụ APC nwetere na ụlọikpe dị na Zamfara makana ha sị na ya bụ ụloikpe enweghị ikike iji nabata ya bụ ikpe na mbụ. Idris kwesiri i soro ndị ga-anata ""Certificate of Return"" taa bu Wenesde, ụbọchi nke iri abụo na asaa nke ọnwa Maachị. Ndị agha si Chad, Naịjirịa na Cameroon na-ebuso ndị Boko Haram agha UN etinyela anya na ego na ọgbaaghara Kameron Otu UN na ahụ maka ndị gbara ọsọndụ bụ UNHCR arịọla ndị ụwa ka ha tụta ego dị otu narị nde dola na iri asatọ n'ụma ($184 million) bụ nke ha sị na ha ga-eji leta ndị gbara ọsọndụ na Cameroon. Ihe ruru mamdụ ndị narị anọ (400,000) ndị Cameroon nọ n'ọsọndụ kemgbe ndị otu ekweghịekwe na ndị gọọmenti nọ n'akwata. Gee nkeji a n'uju ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyị taa: Igbo Language: Gịnị bụ 'Umbrella' n'asụsụ Igbo?" afirika-43460320,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43460320,BBC: Anyị ga-akpọpe ụlọọrụ anyị na Lagos nwanne echi,"A ga-eme mmeme ahụ n'ụlọọrụ anyị dị na Ikọyị Lagos n'Elekere anọ nke ehihie Wenezde, ụbọchị nke iri abụọ na otu ọnwa Maachị afọ a.","BBC: Anyị ga-agbape ụlọọrụ anyị na Lagos maka ịgbasa ozi na Ọdịda Anyanwụ Afrịka Ndị ọbịa a na-atụ anya ha gunyere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria dịka nnukwu ndị ndọrọdọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego na ihe nkiri. Onyeisi BBC na mpaghara ọdịda-anyawụ Afrịka bụ Oluwatoyosi Ogunseye kwuru na mgbape ahụ bụ nnukwu ihe nyere BBC n'ihi na ọ na-ehazigharị ka BBC si agbasa ozi banyere Naijiria na mba ndị ọzọ. ""Mgbape na-ehazigharị ka BBC si agbasa ozi banyere Naijiria na mba ndị ọzọ. Ụlọ ọrụ a bụ isi ụlọọrụ nke BBC na ọdịda anyanwụ Afrịka na-achịkọta agbasa ozi n'asụsụ bekee,Awụsa, Frenchị , Pijin, Igbo na Yoruba. ụlọọrụ anyị a ga na-eme akụkọ maka radiọ, onyonyo TV na dijital."" Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị ịsị ọrụ BBC na mpaghara akụkụ ụwa ndị ọzọ erutela na Lagos maka mmemme a dị oke mkpa nke Directọ BBC nke mba ụwa bụ Jamie Angus ga-esonye. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43297843,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43297843,PSG a ga-akpanwu ike ka Neymar anọghị n'asọmpi ha na Madrid?,Mmerụ ahụ onye egwu ndị Paris Saint Germain (PSG) bụ Neymar merụrụ o nwere ike ime ka-agbapụ ha n'asọmpi Champions League ha na Real Madrid ga-agba taa?,"Neymar agaghị asọmpi ọzọ ruo mgbe 'season' 2017/2018 ga-agwụ Mmekpa ahụ na-eche PSG ka ha na Real Madrid ga-asọmpi 'onye ike ga-agwụ' iji mara ma ha a ga-enweta mmeri iji gaa n'ihu na Champions League. Real Madrid gbara ha 3-1 n'asọmpi nke mbụ, n'agbanyeghị na Neymar so gbaa egwuregwu ahụ. Kama, ihe agbanweela maka na ahụ ọ merụrụ ka ha na Marseille sọrọ mpi nwere ike ime ka ndị otu ya taa ahụhụ ma ọ bụrụ na Madrid chịrị ọkụ bịa. Neymar merụrụ ahụ n'asọmpi PSG na Olympics Marseille gbara n'ụbọchị 25 nke Febụwarị 2018 Onye egwu PSG ọzọ bụ Angel di Maria ga-eduputa ndị otu ya ma ha na Real Madrid bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ zute taa. Di Maria enyela goolu asaa n'ime egwuregwu isii ikpeazụ ọgbarala. Mana obi kara onye ncheazụ ha bụ Dani Alves na ha ga-emeri. O kwuru sị ""anyị nwere ike ịnọ ala bee akwa, maọbụ anyị ebilie ọtọ mee ihe anyị nwere ike ime."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48819537,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48819537,Madagascar vs Nigeria: A gbanyela Super Eagles anya ajụ,Madagaska ji ọkpụ goolu abụọ apịa Naịjirịa ụtali n'asọmpi Total AFCON n'Ijipt mabụrụ ndị mbụ n'otu ha.,"Madagaska ji ụtụtụ gbaa aka ahịa site na goolu Lalaina Nomenjanahary nyere mgbe Leon Balogun mehere n'ihu ọgbọ neetị nke Naịjirịa na nkeji 13. Dịka ọ dị ugbu Madagaska na-acha Naịjirịa ezigbo ọkụ dịka a na-atụghị anya maka na Naịjirịa ka nwere ndị egwu karịa ha. N'ime ọkara asọmpi a, Madagaska siri ọnwụ na Naịjirịa agaghị enyeta ha goolu ọbụla. Na nkeji 53 Madagaska mezuru ya abụọ site na ""Free kick"" Carolus Andriamahitsinoro gbara nkre kụrụ Wilfred Ndidi na-azụ ma banye na neetị. Ndị Madagasaka kere Super Eagles agbọ ma tọgbọọ ha, nke mere ha enweghi ike ịgbọ ụja ọbụla rue ngwụcha asọmpi a. Mmeri a mere ka Madagaska bụrụ ndị mbụ n'otu B nke asọmpi a." afirika-44135415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135415,Ụlọikpe akagbuola nkwụsịọrụnike Omo-Agege,Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajula ịkagbu nkagbu o mere banyere nkwụsịọrụnike nke ụlọomeiwu ukwu mere Sineto Omo-Agege.,"Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla ịkagbu nkagbu o mere nkwụsịọrụnike nke ụlọimuwu mere Sineto Omo-Agege. Omo-Agege kwubụrụ na ọ ga-ebido ọrụ ya n'ụlọomeiwu ụbọchị Tuusde mana anya ahụghị ya. Omechara ga orụ taa, mana ọnọteghi aka tupu ọ pụọ. N'otu aka ahụ, ndị ụlọomeiwu Sineti kwuburu na ha agaghị enye ya ohere ma meecha kwuo na ha egbochighị ya ibido ọrụ ọzọ. Cheta na ndị ụlọomeiwu ukwu kwụsịrị Omo-Agege ọrụ n'ike n'ihi na ọ na-akwụnyere Buhari na nhazigharị atụmatụ etu ntuliaka 2019 ga-esi ga mana ọ gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe ma merie. Ndị Sinetọ kwuburu na ha agaghị ekwe ka o bido oru mana ha mechara kwugharịa. Nhazi atụmatụ ntuliaka 2019 nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec n'aha ịchafụ wepụtara buwere ntuliaka ọkwa onyeisiala ụzọ mana ụlọomeiwu ukwu tụgharịrị ya. Onyeisiala Muhammadu Buhari jụkwara itinye aka na iwu ahụ oge Sineti mechara nke a. Akụkọ ga-amasị gị:" 43041240,https://www.bbc.com/igbo/43041240,Mmadụ 136 esịla Libya laghachịte n'ụtụtụ a,Agba ọzọ ndi Naịjiria tọrọ na Mba Libya anatala Pọtakọt na Rivers steeti.,"A ga-akpọ ndị steeti ha bịa kpọrọ ha ma ha denye cha afa ha. Ndị nke a bụ agba nke ise ga lọta n'afọ a. Ngalaba n'ahụ maka ihe mberede nke a na-akpọ NEMA sị na eji ụgbọelu Medview were bunata ha n'ụtụtụ ebe elekere 1:10. Onye n'ekwuchite ọnụ ndị NEMA bụ Sanni Datti gwara BBC n'elu ekwe ntị na ndị ahụ ka n'edenye aha ha ma na nara kwa ọgwụgwọ. Ndenye aha nke a ga-enye aka ịmata ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị na ụmụaka n'ime mmadụ narị iri atọ n'isii natara. Akụkọ ka n'abịa." 42797566,https://www.bbc.com/igbo/42797566,Ndị gbara ọsọndụ Kamerunu 'karịrị ụgboro atọ' na Naijirịa,Ndị ọrụ enyemaka na Cross River steeti gwara BBC na ihe dịka mmadụ puku iri atọ na puku atọ si mba Kamerunu bata Naịjirịa.,Ndị na-agba ọsọ mmegbu na mwakpo a na-eme ndị akụkụ na-asụ bekee na Kamerunu Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ihe mberede na steeti ahụ bụ John Inakuththe kwuru na ọnụ ọgụgụ nke a bụ ezie. O kwukwara na ọnọdụ ndị ahụ na-emebị kwa ụbọchị na-aga mana ha na-akwado irụrụ ha ebe obibi nke nta. Ndị ọrụ ebe ahụ na-akwado ibido denyewe aha ndị ahụ gbatara ọsọ na Naịjirịa ka ejiri ya mara ihe a ga-emere ha. Otu nwoke n'ime ndịa na-agba ọsọndụ gwara BBC na ọ nọrọ izuuka asatọ ebe ọ na-agagharị n'ime ohịa. mba-uba-43001001,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43001001,Mba Amerịka agbachiela nke ụgboro abụọ n'afọ a,Gọọmentị etiti mba Amerịka akwụsịla ọrụ nke ugboro abụọ n'ime afọ a maka ụlọ omeiwu emechaghị ihe ha kwesiri ime.,"Nke a bụ ugboro abụọ gọọmenti etiti Amerịka ga-agbachi Ndị Sịnetị na-agba mgba ekwenyeghị nke Rand Paul, onye otu Republican kwuru mana akwụkwọ ahụ gaferela rue ụlọ omeiwu nke ukwu maka nkwado site na ntuliaka Ụlọọrụ ndị dabere n'elu ego gọọmentị etiti ga-akwụsị ọrụ ma o ruo etiti abali. Ọ bụrụ n' ụlọ omeiwu nke ukwu mee ntuliaka a ọsịsa, bụgara ya onyeisi ala bụ Trump tupu ụtụtụ eruo na bee ha, enwereike i gbochi mmechi gọọmenti ahụ. Ka akụkọ na-apụta amabeghị etu mgbachi a ga-esi metụta ụlọọrụ ndị gọọmentị, amabeghị ma ndị mmadụ a ga abịa ọrụ maọbụ nọrọ n'ụlọ." 49374979,https://www.bbc.com/igbo/49374979,Inflation Drop: Ọnụahịa ihe nri gbaturu n'ọnwa Julaị karịa nke ọnwa June,Ọnụ ahịa nrị nakwa ihe ndị ọzọ gbaturu n'ọnwa Julaị karịa ka ha dị n'ọnwa June dịka ngalaba 'Nigeria Bureau of Statistics' siri kwuo.,"Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile NBS kwuru na ọnụahịa ihe nrị n'ọnwa Julaị dị pasenti 1.26, ebe nke ọnwa Juun dị pasentị 1.36. Ihe mgbada ọnụ ahịa pụtara ụmụ Naijiri- Ọkachamara akụnaụba Chetakwa na BBC Igbo bara n'ime ahịa n'ọnwa gara aga ebe ndị ahịa kwuru na n'ezie ọnụ ahịa nri dị ala karịa ka ha dị na mbụ. Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie? Ikpe dị n'etiti Naijiria na P&ID Otu ọkaikpe na mba Ingland enyela otu ụlọọrụ aha ya bụ P&ID ikike ịchọ ụzọ ha ga-esi nara gọọmentị Naijiria ihe ruru ijeri dọla itoolu maka inupu isi na nkwekọrịta gbasara mmepụta ikuku gaasị. Ụlọọrụ ahụ kwuru na gọọmentị Naijiria laghachiri azụ na nkwekọrịta ha nwere maka ịrụ ebe a na-emepụta ikuku gaasị na Kalaba. Trump chọrọ ịzụ Greenlad Greenland bụ obodo dị na mpaghara Denmark mana ha anọghị n'okpuru ochịchị ya. Na mba ofesi, mba Greenland agwala onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ha anaghị ere obodo ha ere kama na ha ga-anabata onye ọbụla chọrọ iso ha zụkọọ ahịa. Akụkọ kwuru na Trump ekwuputala mmasị ya ka Amerịka zụrụ obodo Greenland. Fifa enyela Siasia ọsọ Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011 N'egwuregwu, Fifa enyela Samson Siasia ọsọ ụwa ebighiebi n'egwuregwu bọọlụ ma dakwaa ya nha mara abụba maka nrụrụaka. Kọmịtị Fifa na-ahụ maka agwa ziri ezi kwuru na ikpe mara Siasia n'ebubo ịna akaazụ iji nwogharịa ụfọdụ asọmpi. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ" afirika-49043504,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49043504,Igbo cuisine: Ana m amalite ọrụ n'elekere atọ nke ụtụtụ - Onye Abacha,Ndị na-atụ mgbere n'ahịa Ladipo ma Grace Igwe dịka onye na-ere abacha.,"Mana ọ bụghị sọsọ ihe nwaagbọghọ ahụ na-eme. Nwa ada Igwe sị na olileanya ya bụ ịgụ egwu, ma gakwaa mahadum ga mụọ atụmatụ egwu. Iji mezuo ihe a, ọ na-ere abacha iji kpata ego. Ọ sị na nne na nna ya na-akwado ya ọfụma. O kwukwara na agbanyeghị na ụmụnwoke na-enye ya nsogbu, uche ya dị n'ihe ọ chọrọ bụ ịbarụ onwe ya uru. Kirie ihe onyonyo a ka ị mata ya n'uju: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48584017,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48584017,Abia Assembly: 'Ikuku' ekuola ndị Abia dịka Chinedum Orji bụrụ onyeisi ụlọomeiwu ha,Ndị ụlọomeiwu ọhụrụ nke Abia Steeti ahọpụtala Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu Abia ka ọ bụrụ onyeisi ha.,"Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu. Ndị ọzọ nwetere ọkwa gụnyere Ifeanyi Uchendu nke Ohafia South dịka Osote onyeisi. Solomon Akpulonu nke PDP onye ndu pati kachasị, Abraham Oba nke APGA dị ka onyendu pati dị nta. Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu. Chukwu Chijioke nke APC dịka osote onye ndu pati kachasị, Paul Taribo osote onye ndu pati kachasị nta. Munachim Alozie dịka 'Chief Whip', Chukwudi Apugo dịka osote 'Chief Whip'. Ọ bụ omeiwu Munachim Alozie họpụtara Orji dịka onyeisi, ebe omeiwu Ginger Onwusibe kwenyere ya, mana onweghi onye ọzọ mara ya aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50873630,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873630,Gịnị ga-eme ka nwoke a bekachaa ụmụ ya atọ?,Ndị uweojii n'Ebonyi steeti anwụchiela otu nwoke ji mma ekwu wakpo ụmụ ya atọ.,"Ụmụaka abụọ n'ime atọ anwụọla ebe nke atọ na-alụ ọgụ ọnwụ na ndụ. Nwoke ahụ aha ya bụ Chinasa Ogbaga gbara nwunye ya alụkwaghịm kemgbe ọnwa Febụwarị afọ a. Nne ya kwuru na ọ chere na ọ bụ Ogbanje na-enye nwa ya nsogbu. Onye na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odeh gwara ụlọ ntaakụkọ Punch na ha ebidola ịnyocha ya bụ okwu. Kedụ ihe na-akpata ụdịrị omume a? Otu dọkịta na-ahụ maka ahụike ụbụrụ bụ Aroyewu Afolabi kọwara BBC Igbo ụfọdụ ihe na-akpata ụdiri omume a. O kwuru na onye na-anọkata mee ihe atụghị anya n'aka ya dịka nke a nwere nsogbu ahụike ụbụrụ. Maazị Afolabi kọwara na nsogbu ahụike ụbụrụ anaghị egosiputa onwe ya n'omume mmadụ mgbe niile. Mana lee ụfọdụ ụzọ e nwereike ịsị chọpụta na mmadụ na-enwe nsogbu ahụike ụbụrụ. - Mgbe ọ rara mmadụ ahụ ịhi ụra n'abalị - Mgbe ọ dị mmadụ ka ihe a na-arịgharị ya n'ime ahụ maọbụ n'ụbụrụ. - Mgbe mmadụ na-anụ olu sọsọ ya na-anụ maọbụ hụ ihe sọsọ ya na-ahụ. - Mgbe mmadụ bidoro ịhụta onwe ya dịka ihe ọ bụghị ịmaatụ mmadụ nọkata kwuwe ""a bụ m chukwu"". O kwuru na ndị mmadụ ịkwu na ihe niile bụ maka ajọ mmụọ so na ọ dachi ịchọpụta ndị nwere nsogbu a. Na ngwụcha, o kwuru na ọ bụghị sọsọ ụzọ ndị a ka-esi a ma ndị nwere nsogbu kama ka ndị mmadụ mụrụ anya ka azụ ma omume mmadụ gbanwee. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48665066,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48665066,Nigeria vs France: Fransị agbarala Naịjirịa ụgbọ nwamkpi?,Ngwongwo eji mara Super Falcons kụwasịrị taa dịka Fransị meriri ha n'asọmpi Ikombaụwa ụmụnwaanyị.,"Ọ bụ ihe ịtụ anya mgbe Renard nyere goolu ya na nkeji 79 maka na ọ bụ ugboro abụọ ọ gbara ya bụ penariti. Nnadozie chetara penariti nke mbụ Renard gbara mana ọ dara iwu nke teknụzụ VAR gosiri eji nye ya ọzọ. Iwu a ọ dara mekwara na Nnadozie dị afọ 18 rite akwụkwọ edo ebe Ngozi Ebere ritere akwụkwọ ọbara na nkeji 75. Norway ji kwa goolụ abụọ merie mba Sawụt Koria mgbe ha zutere onwe ha. Frans pịara Saụt Koria 4:0 ma jirikwa 2:1 merie Norway, nke nyere ha owere ịbụrụ sọsọ ndị gafere agba nke abụọ na ""Group A"". Naịjirịa na onwe ha agbataghị ihe mgbe ha zutere Norway ji 3:0 sị ha ga nu mụta ọfụma. Falcons na-eche ugbua ịchọpụta ma ha a ga-alachita ma ha a ga aga ihu n'asọmpi a. Ogbunigwe agbagbuola mmadụ iri atọ na Borno Ndị ọrụ gbata gbata na-ekwu ọnụ ọgụgụ mmadu nwụrụ n'ebe ndị omekome atọ gbara ogbunigwe dị ha n'ahụ na Borno Steeti nwereike rịa. Mmadụ iri atọ nwụrụ n'ihe a mere n'ebe a na-ekiri TV ka ihe ruru mmadụ iri anọ n'asatọ merụrụ ahụ. Onwebeghị otu sị na ọ bu ha kpara mkpamkpa a. Ihe Peter Obi gwara Buhari ""mewe ka ndị isiala India na Saụt Afịrịka!"" Onye kwuru nke a bụ aka chịbụrụ Anambra steeti bụ Peter Obi ka o na-adụ Onyeisiala Buhari ndụmọdụ maka ime ọsịsọ wepụta aha ndi ya na ha ga-arụ ọrụ. Onye ga-achị Osun steeti? Ọ bụ n'ụbọchị nke ise nke ọnwa Jụlaị ka a ga-ama onye ga-akwụrụ ka gọvanọ Osun steeti. Ụlọikpe ukwu bụ Supreme Court ga-ekpebi ikpe dị n'etiti Ademola Adeleke nke PDP na Gboyega Oyetola nke APC maka ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ." afirika-49348942,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49348942,Enugu meat suspension: Ndị na-ere azụ na-achị ka ọdọ anụ Enugwu tọgbọ chakoo,"Iji rube isi n'iwu ndị Miyetti Allah tinyere, o nweghị ebe e gburu anụ ma ọ bụ ree anụ n'ahịa niile dị n'Enugwu steeti taa ụbọchị 14 Ọgọst, 2019.","Miyetti Allah: Ahịa a gbachiri sụrụ m ụsụ Mgbe BBC rutere n'ahịa 'Old Artisan' na New Haven, Enugwu, ọdụ ebe a na-egbu ma na-ere anụ anụ tọgbọọ chakoo. Ọtụtụ ndị na-ere anụ nọ n'ọdụ ahịa ha ma ha anaghị ere ihe ọbụla. Ha kwupụtara obi ha na mgbachi a gbachiri ọdụ ahịa ha na etu o si metụta ha. Ha kwuru na agbanyeghị na o metụtara azụmaahịa ha kama na ọ bụ ihe banyere nchekwa ndụ na akụnaụba n'Enugwu Steeti. Benjamin Nnamani bụ onyeisi ndị na-egbu anụ kwuru na ha kwadoro nzuko gọọmentị na ndị Miyetti Allah bụ nke mere e ji gbachie ahịa ha. Otu nwaanyị bụ Oriakụ Ude bịara ịzụ anụ kwuru na obi adịghị ya mma na ọ hụghị anụ ọ ga-azụ. Cheta na ndị isi ahịa n'Enugwu esorola nzọmụkwụ otu Miyetti Allah n'ịmachi ogbugbu anụ ọbụla n'abalị abụọ. Abalị abụọ ahụ bụ ụbọchị 14 na 15 n'ọnwa ọgọst ebe ndị Miyetti Allah manyere ndị otu ha ọzụzụ nchekwa. N'ime akwụkwọ ozi nke BBC bitere aka, ndị isi ahịa machiri ""ogbugbu na ọzụzụ anụ ehi ọbụla"" ""Anyị na-agwa ndị otu anyị na a ga-agbachi ụlọ anụ onye ọbụla dara iwu a ebighebi"" ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47551338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47551338,Tanker Accident: Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi,"Ụgbọala 'Tanker' bu mmanụ ọkụ dapụrụ na ""gear"" kwọgbuo ndị mmadụ n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde.","Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ, ma gbuo ọtụtụ ndị ọzọ. A mabeghị mmadụ ọle nwụrụ mana otu onye nọ oge ya bụ ihe mere kwuru na ihe nwụrụ ruru iri. O kwukwara na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede a mere. Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ. Ebe Uche Nwosu kwụ ugbua, Uche Nwosu bụ onye a kpọpụtara aha ya dịka onye gbara onye abụọ na ntuliaka gọvanọ Imo steeti, ekwuola na ọ ga-aga ụlọikpe ịzọ mmeri ọ sị kwesịrị irute ya aka. Ọ gwara BBC Igbo sị: Aga m anabata mkpebi ụlọikpe mgbe m garuru - Uche Nwosu N'akụkọ yiri ya, Onye bụbu onyeisi otu APC n'Imo steeti bụ Dan Nwafor, gwara BBC Igbo na APC chụpụrụ Hope Uzodimma maka ime ihe bekee kpọro ""anti-party activities"". Nwafor kwukwara sị na Emeka Ihedioha bụ onye Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri na ntuliaka Imo steeti, ekwesịghị inweta mmeri makana o nwerughi opekatampe pasentị iri abụọ na ise n'ime vootu a tụrụ n'okpuruọchịchị iri na asatọ n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na asaa dị n'Imo steeti. Gụọ ihe ndị o kwuru n'uju ebe a: 'PDP enweghi mmeri n'Imo state' - Nwafor Ụlọelu dara na Legọs, Nke na-eme ugbua bụ na ihe ruru ụmụakwụkwọ asatọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ narị ka tọrọ n'okpuru ala ka ụlọelu ruru ogogo atọ dara na Legọs taa. Otu onye ụlọọrụ kwuru na a zọpụtala ihe ruru ụmụakwụkwọ iri anọ. Bịa na Facebook BBC News Igbo, ebe ị ga-ahụ ihe onyonyo na-egosi ka o si aga ugbua. Akụkọ etu o si mee dị ebe a: Building collapse in Lagos; Ihe karịrị mmadụ itoolu anwụọla n'ime ụlọ dara na Legọs Lee ihe nkiri na-egosi ka e si agbalị ịkpọpụta ndị mmadụ ebe a: Nakwa N'egwuregwu, Ọ ga-akpọtụ taa mgbe Barcelona ga-ezute Lyon, ebe Bayern Munich ga-ezutekwa Liverpool ịzọ onye ga-abanye agba anọ-ikpeazụ. Ọzọ, Ogbonnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo agwaala ndị Igbo niile ma ndị bi na mba ofesi ha gbakọọ aka tinye ike n'iwulite ala Igbo. Ọ gwara ha mee ka ala Igbo bụrụ ebe ga na atụ ndị ọzọ akpịrị. N'ime ozi ọ zigara BBC Igbo, o ji kwa ohere ahụ kelee ndị Igbo maka etu ha si pụta n'igwe mmadụ sonye na ntuliaka abụọ e mere, sị ha ""jisienu ike"" Ọzọ, Ngalaba Inec ewepụtala ụbọchị iri abụọ na ato nke ọnwa Maachi dịka ụbọchị a ga-emegharị ntuliaka n'ebe niile emerughi ntuliaka n'isi nke Bekee kpọrọ inconclusive. Na mba ofesi, Dịka obodo ndị ọzọ na-amachi ụgbọelu Boeing 737 Max, Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba Amerịka ajụla ịme ka ibe ha mere. Nkọwa ha bụ na nyocha ha mere egosighi ihe ọbụla adịghị mma nke mere n'onweghi ihe a ga-atudo aka were machie ya bụ ụgbọelu N'egwuregwu, Man City akwọpịala Schalke 04 ka agbụsị mgbe ndị Schalke bịara n'ọgbọ egwuregwu Etihad dịka ha ji goolu asaa asataghị otu dọọka neeti ha. Site na mmeri a, Man City ekwoferela banye n'agba nke anọ-ikpeazụ n'asọmpị ahụ." media-45463851,https://www.bbc.com/igbo/media-45463851,'Abba Kyari enweghi ike ịnata aka azụ' - Garba Shehu,Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na akụkọ kwuru na Abba Kyari bụ onyeisi ndị ọrụ onyeisiala nara aka azụ bụ okwu asị.,"Garba Shehu kwuru na ebubo eboro Abba Kyari bụ asị Otu ụlọ mgbasaozi bipụtaaburu akụkọ kwuru na Kyari nara ngarị ruru nde naịra 29 iji nye ọrụ maka mbubata ụgbọala Hiluz mkpụrụ 15. mana onye nkwuchiteọnụ onyeisla bụ Garba Shehu kwuru na akụkọ ahụ na-akpasu iwe maka na onweghi mgbe Kyari na onye ọbụla nwere ọgbakọ nzuzo. Shehu kwuru na ebubo ahụ si n'aka ndị na-achọ ịkatọ onyeisiala dịk ntuliama 2019 na-akpudebe nso. Mana na nzaghachi nke ya, Kyari kwuru; "" Onweghi eziokwu dị n'akwụkọ ahụ, ọ bụ asị ọcha. Onweghi ụdị pọtị ha chọrọ ite m ga-anyado. ""Agwala m ndị ọkaịwu m ka ha kpụpụ ndị na-ebu akụkọ asị ahụ ụlọikpe."" Nke abụghị mbụ a na-ebo otu onye ọrụ Buhari ebubo ngari na aka azụ agbanyeghi ọgụ gọomenti na-alụsọ mpụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43580149,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43580149,Malala Yousafzai alaghachila Pakistan,Nwaanyị a ma ama ma turu ugo Nobel bụ Malala Yousafzai alaghachila obodo ya bụ Pakistan nke mbụ kemgbe ndị agha Taliban gbasịrị ya egbe n'afọ 2012.,"Yousafzai nke na-agụ akwụkwọ ugbua na mahadum Oxford dị na UK, nara mgbọ ahụ oge ọ dị afọ 15 Yousafzai bụ onye dị afọ 20 ugbua ma bụkwara onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara oke na ugwu ruru mmadụ natara mgbọ ahụ maka na ọ na-ekwupụta ka ụmụaka ụmụnwaanyị gụọ akwụkwọ. Ya na onyeisiala mba Pakistan bụ Shahid Khaqan Abbasi kwesiri inwe ọgbakọ na njem ahụ o mere. Ekwupụtaghị n'uju ihe gbasara njem ahụ ọ na-eme maka okwu gbasara nchekwa ya. Mana ndị ọrụ mgbasaozi TV na Pakistan gosiri Malala na nne na nna ya na ọdọụgbọelu ndụ Pakistan na Islamabad dịka ha nọ ma nwe nchekwa pụrụ iche. Njem ya kwesiri iru mkpụrụ ụbọchị anọ ebe ya na ndị ọrụ ya a na-akpọ Malala Fudn Group so mee ya bụ njem. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53833594,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53833594,Justina Obioma Ejelonu: Ekene ka na-agara nwaanyị Igbo ya na Stella Adadevoh nwụrụ maka Ebola,Ụwa ka na-eto Stella Adadevoh na nọọsụ Justina Ejelonu tufuru ndụ ha maka igbochi mfesa ọrịa Ebola.,Ha abụọ bụ ndị ọrụ ahụike nabatara nwoke Liberia ahụ akpọrọ Patrick Sawyer n'ọnwa Jụlai 2014. Etu Stella Immanuel si kwuo maka Hydroxychloroquine na Zithromax ezighi ezi- Ndị Dọkịta Naijirịa Otu onye ozi ya dara ụda bụ nke di nọọsụ Justina Ejelonu depụtara nwute ya n'akara twitter ya. Di ya bụ Dennis Akagha kwuru na ọ na-echeta nwụnye ya nwụrụnụ kamgbe afọ isii maka Ebola mere ka eburu ya buga n'ebe ndopu. Akagha depụtara na nwunye ya zutere Sawyer bu Ebola n'ụbọchị mbụ o bidoro ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ ọ biara ịnata ọgwụgwọ. O kwuru na ihe na-ewute ya bụ etu ndị mmadụ si na-eto sọsọ dọkịta rụrụ ọrụ ụbọchị Patrick Sawyer bu Ebola bata ụlọgwụ ebe nwunye ya na-erụ ma hapụ ito nọọsụ Justina Ejelonu tufuru ndu ya ebe ọ na-agwọ Sawyer. Dennis kwuru na o nwekwara ndị so wee lekọta Sawyer anya ebunyeghị ụkpa ekele. @Iam_KingBuchi si na dịka a na-echeta dọkịta Stella Adadevoh ka ghara ichezọ nwada nọọsụ Justina Ejelonu a na-akpọtaghị aha dịka ndị nwụrụ maka Ebola. Mana ndị mmadụ nọkwa na-ebunye dọkịta Stella Adadevoh ụkpa ekele agbanyeghị nke a. Onyeọrụ BBC kelekwara dọkịta Adadevoh etu kwụsị mfesa ọrịa Ebola na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 50462532,https://www.bbc.com/igbo/50462532,'Biafra na-enye anyị ohere ihe anyị nwereike ịbụ' - Ọkaikpe Nkemdilim Izuako,Okwu inweta Biafra bụ nke na-ewu ewu kamgbe ebe ọtụtụ ndị Igbo ọkachasị ndị ntoroọbịa na-ekwu ka e mee refarandum.,"Okwu a bụ nke na-ebiri ọkụ kamgbe nke mere na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa etinyela ya ọnụ. BBC Igbo zutere otu onye ọkaikpe na-arụ n'otu mbaụwa United Nations aha ya bụ Ọkaikpe Nkemdilim Izuako bụ onye tinyere ọnụ n'okwu gbasara Biafra. O kwuru na ya na-echeta agha Biafra, na ya na-eji obi aṅụrị echeta ya maka na agha ahụ gosiri ụmụIgbo ihe ha nwereike imepụa n'onwe ha mana o bere arịrị na agha bere, ụmụIgbo etufuo ihe niile ha mepụtara oge agha. O kwuru na ugbua, okwu Biafra ekwesighi ịbụ ịzọ oke ala kama ndị ọnụ na-eru n'okwu kwesiri ịkpa nkata ime ụlọ gbasara ya. Gịnị ka ha ga-akpa n'ime ụlọ, kirie onyonyo a ka ị chọpụta ihe ọ gwara BBC Igbo. Akụkọ ga-amasị gị:" 43055204,https://www.bbc.com/igbo/43055204,Ipob si ka aga n'iru enye mkpebị ruru Nnamdi Kanu,Ndị na-azọ ikewa Naijirịa iji nweta mba ha ga akpọ Bịafra bụ Ipob kwuru na ụlọịkpe Naịjiria ebe a na-ekpe ịkpe onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu kwesiri ime ọsọ ọsọ kpebie okwu gbasara ya.,"A ka na-achọ onye isi ndị Ipob bụ Nnamdị Kanụ Ha kwuru na ụlọikpe kwesiri ị ga-ihụ n'ikpe ahụ n'agbanyeghi na akwụkwọ ịkpe ya furu efu. Onyeisi nhazi na Ipob bụ Mazi Chika Edoziem kwuru na ihe ọ bụla ga-egbu oge n'inye ikpe a bụ mgbochi ikpe ziri ezi. Ipob kwuru na onwebeghị na ndụ Naịjiria ebe akọrọ akụkọ n'akwụkwọ ikpe ha ka nke a furu efu n'ụbọchị ekwesiri ịnye mkpebi ya. Ajụjụ Edoziem na-ajụ bụ: ""Kedụ ebe akwụkwọ ikpe Nnamdị Kanụ dị?"" Ọ sị na ọ bụrụ eziokwu na akwụkwọ ahụ furu efu na ndị ọkaịkpe ukwu kwesiri inwe nke ha a ga-eji maatụ. ""Nke a egosiri na ụlọikpe ndị Naịjiria enweghị ike ịchekwa ihe ndekọ na mkpebi ha nyere n'oge gara aga?"" bụ ihe Edozem na-ajụ. Ọ jụkwara si, ""Ọ pụtara na ndị ọkaikpe ukwu Naịjiria anaghị eso ihe iwu kwuru?"" Ọ sị na omume nke a n'esgosi na onwere ndị na-agba izu ọjọọ n'imegide ịkpe ziri ezị ekwesiri ịnye Kanụ. A maghị ebe Nnamdi kanu kamgbe ọnwa September afọ gara aga oge ndị agha wakporo be ya na Afara Ukwu Abia steeti Anyị na-agba mbọ ị nweta okwu ndị ọkaịkpe ukwu maka akụkọ a, dịka ọ sị-aga, akụkọ ka na-abịa." afirika-49713270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49713270,Saudi Arabia attacks: Nigeria ga-erite uru na mbuli ọnụego mmanụ agbịdị,Ala adịghị mma bụ uru ndị nze ka ọ dị ugbua n'okwu banyere mmanụ agbịdị na mbaụwa niile.,"Ndị nwe ụgbọala na-achọ ụzọ ọbụla inweta mmanụ ụgbọala Ọnụego mmanụ agbịdị arịala elu nke kachasị ibe n'ime ọnwa anọ n'ihi ogbunigwe a gbara n'ụlọọrụ mmanụ agbidi mba Saụdi Arebia n'ụbọchị Satọde. Dịka ọ dị ugbua, Saụdi Arebia akọwabeghị nke ọma etu mwakpo a si mee mana ha kwuru na onweghi onye merụrụ ahụ. Kedụ etu ọ ga-esi metụta Naịjirịa? ụdịrị ụgbọmmiri a awakporo Ndị ọkachamara n'okwu akụnaụba na Naịjirịa kwuru na nke a bụ ezi ihe nye Naịjirịa na akụnaụba ya dịka mmanụ agbịdị bụ ụzọ kachasị ha si enwete ego. Ugo Obi-Chukwu kwuru na nke a ga-emetụta Naịjirịa n'ụzọ dị mma dịka ha ga-etinyekwu ego n'ọnụ mmanụ ha, nke bụ dọla iri isii kwa otu ite mmanụ ugbua O kwuru na ọzọ bụ Naịjirịa ga-enwe ohere ire ite mmanụ agbịdị karịa ite ole ha na-ere ugbua nke bụ nde abụọ kwa ụbọchị. Onye ọzọ bụ Chinwe Egwim sị na ihe a mere na Saụdi Arebia nwereike ime ka onụego ite mmanụ rue otu narị dọla ($100/barrel) nke bụ ihe ọma nye Naịjirịa. N'otu aka ahụ ọkanmụta Boniface Chizea sị na Naịjirịa kwesiri iji ohere a rite ezigbo uru tupu ọnụego mmanụ adaa maka na mbuli a agaghị anọte aka. Kedụ ihe ọghọm dịrị Naịjirịa? Ugo Obi-Chukwu sị na dịka ọ dị ugbua ọ na-ara Naịjirịa ahụ ịmịpụta mmanụ agbịdị etu ha kwesiri kwa ụbọchị ka ọfọdụzie ịmịpụta karịa. Ọzọ bụ na ọnụ ego Naịjirịa na-eji ebubata mmanụ ga-arị elu nke nwereike ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Ọ gara n'ihu kwuo na Naịjirịa ga-eri nnukwu uru ma ọ bụrụ na ha nwee ike welite aka n'ite mmanụ ole ha na-ere kwa ụbọchị. Akụkọ ga-amasị gị: Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere" afirika-47877198,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47877198,Champions League: Tottenham apịawaala Manchester City azụ ka Liverpool rachara pịọm n'ahụ Porto,Tottenham dị ọkụ ka ha zutere Manchester City ụnyaahụ n'asọmpị ndị eze bụ UEFA Champions League,"Ọ bụ asọmpị nke abụọ Tottenham Hotspur ga-agba n'ama egwuregwu ọhụrụ ha dịka Son Heung-min mekwara ka onye chụrụ aja goolu na ya bụ ama ka anatara goolu nke abuọ ya ebe ahụ. Tottenham nwetere mmerị n'asọmpị a ka ọ fọrọ nkeji iri na abụọ ka agbacha, agbanyeghi na onye egwu Man City bụ Fabian Delph ji ọkpa ike zọpụ onye ndu ha bụ Harry Kane na ya bu asọmpị. Harry Kane anyanwughi ọkpa ike Fabian Delph kpịara ya Mmeri bịara makana Spurs tara akpụ n'asọmpị a, dịka Man City riri Penaliti enyere ha ma gbakwa ka ndị umengwu karịrị n'ahụ. Ha nwere ohere ịwụ agada nọchịrị ha ụzọ ha ga-eji merie iko a n'ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa April a mgbe ha nabatara Spurs na be ha. Roberto Firmino na-egosi ihe ojiri bụrụ onye egwu pụrụ iche Liverpool ji otu, abụọ sị Porto anyị adịghị achị N'Anfield, ọkwa so ọchị ọchị dị n'ihu ndi egwuregwu Liverpool ka ha kwachara ogbo ha bụ FC Porto ọbịa. Roberto Firmino na Naby Keita bu ndị dere aha ha na goolu abụọ Liverpool ji gba ọchụ n'asọmpị a. Porto gbara mbọ inye goolu nke ha mana onye goolu ha bụ Moussa Marega ahụghị ebe o dobere ụkwụ oji enye goolu n'asọmpị a. N'afọ 2018, ọ bụ goolu ise ka Liverpool jiri nụọ Porto n'ụzọ ibute iko a na-ese okwu, nke bụ na akwụkwọ na-enye ha mmasị imere mgbe ha zutere na be Porto n'ụbọchị iri asaa nke ọnwa April 2019. Moussa Marega hụru ụzọ goolu karịa mmadu niile gbara n'asọmpị a, mana ọhụghị ebe ụkwụ oji enye goolu dị unyaahụ" afirika-55695818,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55695818,Covid 19 Vaccine Nigeria: Ihe mere m mgbe a gbachara m ọgwụ mgbochị covid-19,"Dọkịta Ije Akunyili na-arụ n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị na-arịa covid-19 kwuru na kamgbe ọgwụ mgbochi gbasara covid-19 pụtara , ụjọ anaghị atụ ha ma ha na-eleta ndị na-arịa ọrịa covid 19.","O kwuru na mgbe ọ gbara ọgwụ mgbochi a n'izuụka gara aga, obere ahụ ọkụ metụrụ ya mana o nweghị ihe ọzọ ya bụ ọgwụ mere ya. O kwuru na o teela e bidoro mewe nyocha maka ọgwụ mgbochi a kpatara o ji dị mfe iwepụta ya ugbua. O kwuru ka ndị mmadụ leghara anya izu ọjọ a na-agba maka ọgwụ mgbochi covid-19 nke Pfizer, Moderna nakwa AstraZeneca ma nabata ya iji gbanahụ maka mkpa mkpa covid na-akpa. Dọkịta Akunyili kwuru na ụjọ ya bụ na agaghị enwe ọgwụ mgbochi ole ga-ezu ụmụ Naịjirịa. Cheta na ọ bụ naanị puku narị ọgwụ mgbochị a ka gọọmenti kwuru na ha na-ebute na Naịjirịa n'izu a. Naịjirịa o nwereike ịwepụta ọgwụ mgbochi nke ha? Dọkịta Ije Akunyili kwuru na dịka India, Chaịna nakwa Rọshịa si nwe ọgwụ mgbochi nke ha, Naịjirịa kwesiri inwe ọgwụ mgbochị nke ya. O kwuru na ọ bụrụ na covid-19 a jiri ike bata na Naịjirịa , anyị enweghị ngwa ọrụ ahụike zuruoke imemina ya. Coronavirus: Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara ọrịa a Ọ kwuru na ndị okenye niile gbaa ọgwụ a , ọ ga-amagbu onwe ya ma mee kwa ka anyị mepee ebe niile bụ ebe ọha na Naịjirịa na-atụghị ụjọ. N'okwu ya, ""Gọọmenti kwesiri inyocha etu a ga-esi kesaa ya bụ ọgwụ mgbochị, o kwesighị ịbụ naanị ndị ọchịchị kwesiri inwe ohere ị gbaa ya bụ ọgwụ. Anwụnta anaghị ebufe mmadụ coronavirus O kwuru na gọọmenti kwesiri ịnwe onye dịka dọkịta Fauci nke Amerịka ndị Naịjirịa ga-atụkwasị obi ga na-agwa ndị mmadụ maka etu ihe niile gbasara ọgwụ mgbochi a si aga. O kwuru na ọ bụ naanị ya nwetegoro ọgwụ mgbochi a n'ime ezinụlọ ya bi n'Ameịrịka, ebe ndị ezinaụlọ ya ka na-eche inweta nke ha. Ọgwụ mgbochi covid 19 ọ ga-emebinarị Naịjirịa? Dọkịta Akunyili kwuru na Naịjirịa kwesiri inweta nke AstraZeneca dịka mba na-adịgị enwekarị ọkụ makana ọgwụ mgbochi ahụ anaghị e ji ike emebi dịka nke Pfizer maọbụ Mordena. Dọkịta Ije Akunyili kwuru na o nwere olileanya na anyị ga-apụtali n'oge covid 19 ma ọ bụrụ na anyị na-eme usoro World Health Organisation wepụtara maka igbochị ọrịa a ma narakwa ọgwụ mgbochị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55369509,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55369509,Gọvanọ Hope Uzodịnma ọ chụrụ onyeisi 'Imo state University' n'ọrụ?,Kepukepu na-ekwu na a chụọla onyeisi mahadum nke Imo steeti bụ Ọkankuzi Adaobi Obasi n'ọrụ.,"Mana ozi ahụ ọ bụ eziokwu? ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Mahadum bụ Ralph Njokuobi kwuru sị na ọ bụ eziokwu na-akwụsịrị Obasi n'ọrụ kama na ọ bụ n'ọnwa oktoba nke afọ 2021 ka ekwesịrị ịkwụsị ya n'ọrụ. Njokuobi gara n'ihu kwuo, "" Dịka anyị siri nụ, ọ bụ n'ọnwa oktoba nke afọ 2021 ka ọ kwesịrị imezu afọ ise ya dịka onyeisi mahadum"". Ọ kọwara na ọ bụ ndị Executive Council mechara ọgbakọ ka ha pụtara gwa ndị ntaakụkọ na ha ekpebiela na ọ bụ n'ụbọchi iri atọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2020 ka ọ ga-akwụsi ọrụ dịka onyeisi mahadum. N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba Uzodinma kwuru sị, "" E nweghị onye hụrụ onyeisi mahadum Imo steeti n'ọrụ kama oge o kwesịrị ịnọ n'oche dịka onyeisi mahadum agwụla."" Ọkankuzi Adaobi Obasi Kama kọmịshọna Emelumba kọwara na Obasị rụburu ọrụ dịka onye na-anọchịte onyeisi Mahadum nke IMo steeti otu afọ tupu e mee ya onyeisi ya bụ mahadum n'ụjụ ya. O kwuru sị "" dịka ọrụ gọọmentị siri dị, ọrụọla ọrụ afọ ise dịka onyeisi mahadum ahụ"". Ọ kọwara na agbakọọ otu afọ ọ nọro dịka onye nnọchite onyeisi mahadum ahụ na afọ anọ ọ chịrịla dịka onyeisi ga-eme ya afọ ise ọ kwesịrị ịnọ. Kedụ maka kepukepu na Gọvanọ Uzodinma chụrụ Adaobi Obasị n'ọrụ maka na ọ bụ nwanne Rochas Okorocha? Kepụkepụ na-eso akụkọ a bụ na Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma chụrụ Adaobi Obasị n'ọrụ maka na e nwere etu ya na Rochas Okorocha bụ onye chịbụrụ Imo steeti si bụrụ nwanne. Emelumba zara sị "" Ọ bụrụ na Obasị bụ nwanne Rochas Okorocha, anyị amaghị. Nke a bụ mbụ gọọmentị na-anụ maka nke a"". Ọ jụkwara sị, ""gọọmentị a agbaala otu afọ, gịnị mere na e wepụbeghị ya kemgbe ma ọ bụrụ etu ahụ?"" O kwuru sị, "" ma ọ bụ nwanne Rochas Okorocha, ọ gbasaghị gọọmentị, Anyị nabatara ya dịka onyeisi Mahadum, ọ rụo ọrụ, oge ọrụ ya ebiela"". A họpụtala onye ọzọ ga-anọchị ya? Kọmịshọna mgbasa ozi Imo steeti bụ Declan Uzodinma kwuru na a họpụtabeghị onye ga-anọchị Obasi n'ọrụ. Ọ kọwara na ọ ka nwere izuụka abụọ ịrụ ya bụ ọrụ. Mbọ BBC Igbo gbara inweta uche Ọkankuzi Adaobi Obasi amịtaghị mkpuru dịka a kpọrọ ya n'ekwenti mana ọ zaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43508223,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43508223,Ụmụaka Dapchi ezutela Buhari,"Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, kwuru na ọ bụ ndị ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị otu narị na ise na otu nwoke ha gbapụtara n'aka.","Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Ka ọ si dị onweghị onye ma ọnọdụ ụmụaka ise ndị e kwuru na ha nwụrụ 'ime ndị a tọrọ. Aka ndị Boko Haram ka ji otu nwa nwanyị onye bụ onye otu Kraist nke jurụ ịgọnarị okwukwe n'ime Kraisti. A tọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi otu ọnwa gara aga. Gọmentị na- ekwu na onweghị ụgwọisi ọbụla ha kwụrụ nke o ji enwe onye Boko Haram eji isi ha gbara ụmụaka ahụ. Mana ndọrịtaụka sọ ihe gọọmentị na-ekwu na ọ nweghị ụgwọ a kwụrụ. Bụghị ụmụakwụkwọ Dapchi a tọrọ ji ndụ ha lọta Otu ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Sahara Reporters kwuru na gọọmenti kwụrụ Boko Haram ""nnukwu ego"" ma werekwa isi ụfọdụ ndị Bokọ Haram nọ na mkpọrọ gbara isi ụmụaka ndị ahụ. Ọnụ na-ekwuchiere onyeisiala bụ Garba Shehu gọrọ. Ọ kwara BBC na ntọhapụ ụmụaka dapchi bụ ""nkwekọrịta nwoke na ibe ya""nke butere 'gbanyọọkụ na mkparịta ụka ha na ndị aghaọlụọọla. Ka ọ dị ugbua, otu PDP ekwuola na nntọrọ na mgbapụta ụmụaka Dapchị bụ ụzọ ha ji achọ inweta obi ndị mmadụ maka ntuliaka 2019. Akụkọ ga-amasị gị" 42937829,https://www.bbc.com/igbo/42937829,"Na ubọchị Kansa na ụwa niile, a na ajụ maka ohere inwete ọgwụgwọ","Naịjirịa so ndị mba ụwa ọzọ etinye anya n'ihe gbasara ụbọchị Kansa nke 2018, ebe ha lebara anya na etu ndị mmadụ ga-esi enweta ohere ime redioterapi nwere ike ịgwọ ha.","Ndị nyocha ka na-achọ ụzọ esi agwọ ọrịa Kansa Ndị ọkacha mara na-ekwu na kansa nke ara, nke akpamamịrị, nke umeji na nke ọnụ akpa nwa (cervix) bụ ọdịrị kansa nke kachasị enye ndị mmadụ nsogbu na Naịjirịa. Ndị International Atomic Energy Agency (IAEA) kwuru sị na enwere nanị ngwaọrụ redioterapi atọ na-arụ ọrụ na gburugburu Naịjirịa, nke kpatara ha ji chere na Naịjirịa so n'obodo ndị kacha nwee mkpa ngwaọrụ a. Nyocha ndị otu Radiation Oncology mere n'ụlọọgwụ ndị mahadum dị na Ibadan bụ University College Hospital (UCH) n'afọ 2016, ha chọpụtara na ihe ruru pasenti iri asatọ na-arịa ọrịa kansa enweghi ego ha ji akwụ ụgwọ iji nwete redioterapi nwere ike ịgwọ ha. Ha chọpụtakwara na ọ na-arakwa ndị na-ebighi nso ebe ngwaọrụ a dị ahụ inwete ọgwụgwọ Ihe ndị mmadụ na-ekwu na igwe okwu ọhụrụ (social media) Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'ihe gbasara ọrịa kansa na ụzọ esi ekpochapụ ya." egwuregwu-43552028,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43552028,Naịjirịa na Serbia: Lee nke ga-eme n'asọmpị nke taa,Naịjirịa na Serbia ga-aso mpi enyi na enyi taa n'ama egwuregwu Hyde Park na London.,"Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi Nke a bụ mbụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles na ndị Serbia ga-ezuko n'ama egwuregwu, mana Naịjirịa na Mba Yugoslavia gbara bọọlụ na nkwado iko mbaụwa nke 1998. Ọbu n'ime Australia ka-esi kewapụta Serbia. Ndị Yugoslavia nyere Eagles ọkpụ goolu atọ na-asataghị otu mgbe ahụ, mana onye onụ na-eru n'okwu banyere egwuregwu bụ Emeka Offor gwara BBC Igbo na Eagles nke taa abụghị nke mgbe ahụ. Maazi Offor sị na ndị otu Super Eagles nke taa zuru ka-eme ka ha na-ejikere nkwado iko mbaụwa. Akụkọ ga-amasị gị: ""Moroko ka gbara Serbia otu ọkpụ goolu ha na-asataghị n'izuụka gara aga. Mana, Moroko nọ n'egwu ugbua,"" Offor kwuru. Ọ gakwara n'ihu sị na ya na-ele anya na ike otu (team) abụọ a ga-abu nhatanha n'egwuregwu a. ""Naịjirịa agbaghị ọfụma n'egwuregwu ha na Poland, mana ha ji penariti merie. Serbia akwụsịghị ike n'ọgbọ ugbua, ya mere m ga-eji kwuo na Naịjirịa ga-enwe mmeri n'asọmpi a. ""Serbia agbasịghị ike ka ndị Naịjirịa,"" Offor kwuru. Ndị aga-ele anya Nemanja Matic bụ onye egwu Manchester United, bụ onye egwu Serbia ama ama. Nemanja Matic bụ onye a na-anụ aha ya na Serbia. Victor Moses bụkwa onye aha ya na-ada ụda na Naịjirịa. N'agbanyeghị na-egburu nne na nna Moses na Naịjirịa, ọ na-apụta ma akpọ ya oku Asọmpi a ga-ebido n'elekere asatọ nke taa. Ihe ọzo ị na-amaghị Aha otu egwuregwu bọolụ Serbia bụ 'Orlovi' nke pụtara 'Eagles' na Bekee nakwa ugo n'Igbo. Ya bụ na otu egwuregwu abụọ a na-aza otu aha." afirika-48029232,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48029232,Lee ụfọdụ ihe na-atakasị ntutu ụmụnwaanyị ojii,"Ịkpa ịsị, ite isi ncha(Relaxer) na ịkwanye ntutu rọba (weave-on) emeela ka ntutu nwaanyị a bụ onye mba Sawụt Afrịka dapụsia.","Bandile siri na ọ bụrụ na ọ jiri nwaayọ, na isi nkwọcha ya agaghị eru etu a. Bandile (abụghị ezigbo aha ya) kwuru na mgbe ọbụla ọ tọpụrụ isi o bu, o tee ya ncha isi, kwanye ya ọzọ. Ihe o kwuru bụ: ""O nweghị mgbe m ji ebu ezigbo ntutu m."" Ugbua o nwere ọrịa a kpọrọ ""Traction Alopecia"" nke ọ chọpụtara na o nwere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị. Mana ọ bụghị sọsọ ya na-arịa ọrịa na mba Sawụt Afrịka. Sabi pipo dey draw ear give women of African origin to think twice about dia hairstyling to avoid hair loss Nchọpụta e mere gosiri na ọkara atọ n'ime ụmụnwaanyị Afrịka na-arịa ya bụ ọrịa 'Alopecia.' Ihe ruru pasentị 48 n'ime ụmụnwaanyị puku isii a jụrụ ajụjụ kwuru na ha agagbigala ya bụ ọrịa ntutu isi. Okwu ụgha gbasara ezigbo ntutu mmadụ Bandile na-ebo nsogbu ya okwu ụgha na-ewu nke kwuru na ịkwanye ntutu rọba na ịkpa ya akpa na-enye aka ime ya ka o too. ""Ihe anyị nụrụ mgbe anyị na-eto eto bụ na ntutu a kwanyere ka dị mfe ịhazi karịa ezigbo ntutu anyị"" Ụfọdụ nyocha na-ekwu na ụmụnwaanyị na-emefu ihe ruru ijeri dọlla isii na ntutu nkwanye kwa afọ. Susan Magai nwere ụlọọrụ ebe a na-eme isi tinyere ọnụ na ya bụ okwu: ""Anyị na-agwa ndị na-abịa ịkpa isi ebe a ha ebukarịla isi ha gafee izuụka abụọ"" O kwuru na ụfọdụ mmadụ na-ebu nke ha rue ọnwa atọ nke na-eme ka ntutu ha bido ịdapụ. Ụlọọrụ ya na-enye ọgwụgwọ maka ndị ntutu ha na-adapụ. ""Anyị ji mmanụ akụoyibo eme ya bụ ọgwụgwọ ga-eme ka ntutu mmadụ tochie"" Ntụtụ m dapụrụ mgbe m mụchara nwa ""Ị mụ nwa na oke nsogbu na-eso eme ka ntutu nwaanyị dapụ"" Okwu a si n'ọnụ Jumoke Koso-Thomas bụ dọkịta na mba Briten ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ntụtụ isi. Boitumelo Monyaki kwuru sị: ""A chọpụtara m na n'ezinaụlọ m, ụmụ nwaanyị mụchaa nwa, ntutu ha ebido ịdapụ."" ""Nabata onye Afrịka ịbụ"" Bandile kwenyere na ụmụagbọghọbịa na ụmụntakịrị kwesiri i chegharị etu ha si ebu ntutu isi ha. ""Anyị kwesiri ị na-agwa ha emebila ntutu gị, etela ya ncha isi, nye ya ohere ikutu ume."" O kwuru na nke a bụ ndụmọdụ ga-ebiri oku n'oge adịghị anya dịka ndị mmadụ na-amụta ibu ntutu isi ha etu chi si kee ya." afirika-48412652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48412652,Herdsmen radio: Ọ bụghị maka naanị ndị ọchị ehi - NBC,"Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi bụ National Broadcasting Commission sị na Fulani redio bụ maka iji kuzirie ndị ọchị ehi, ndị ọrụ ugbo na ndị na-akụ azụ ihe.","Ụlọọrụ a gara n'ihu gwa ndị ụlọọrụ ntaakụkọ ka ha kpachara anya etu ha sị akọ akụkọ ihe ọbụla nwereike ikewa ịdị n'otu nakwa udo dị na Naịjira. NBC kwuru nke a na nzaghachị ebubo eboro na gọọmentị nyere ndị ọchị ehi ohere inwe ụlọọrụ mgbasa ozi redio. Site n'ozi ha wepụtara, NBC kwuru na ụlọọrụ 'National Commission for Nomadic Education' tinyere akwụkwọ maka inweta ikike mgbasa ozi. Ndí ọrụugbo NBC nyere ha akwụkọ ikike a n'ụbọchị 28 Seputemba afọ 2018 bụ nke malitere ọrụ site n'ụbọchị 8 Ọktoba afọ 2018 rue 8 Ọktoba afọ 2023. Ha kwukwara na mgbasa ozi ha bụ maka 'ezi mmụta' nke ehiwere maka ndị ọchị ehi, ndị ọrụ ugbo, ndị dinta nakwa ndị na-akụ azụ. Cheta na ọtụtụ otu gụnyere Ipob, Ohanaeze Ndigbo, Afenifere na Middle Belt Forum akatọọla gọọmentị maka inye ohere ihiwe Fulani redio. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43482315,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43482315,Mwakpo Dapchi: Ụmụaka 101 ka akpọghachitere,Mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị naka bụ Lai Mohammed edepụala akwụkwọ gbasara ụmụaka ụmụnwaanyị Dapchi bụ ndị Boko Haram tọrọ ụbọchị 19 Feburuwarị 2018.,"Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Lai Mohammed kwuru na iwu onyeisiala Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa ka ha chọọ ụmụaka ahụ amịtala mkpụrụ dịka ha nwetara mmadụ 101 site n'ime ụmụaka 101 bụ ndị a tọọrọ. Mohammed kwuru na ụmụakwụkọ 101 bụ ndị edepụtara aha ha ebe a ka na-agbapụta ụmụaka ahụ. Ụmụaka ise nime ụmụ Dapchi ahụ nwụrụ oge a kpọrọ ha O kwuru na a gbapụtara ụmụaka ahụ n'ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ taa site n'ụzọ azụ nakwa na-enyemaka ndị enyi Naịjirịa na-achọghị ihe ngo ọbụla. N'okwu ya, ""Ime ka mgbapụta ahụ baa uru, gọọmenti nwere nghọta na tigbuo zọgbuo abụghị ụzọ a ga-eji kpọlata ụmụaka ahụ maka na aga etinye ha n'ihe ize ndụ. ""Nke a kpatara na ejighi ike wee kpọlata ha."" Lai Mohammed kwukwara na oge a na-akpọlata ụmụaka ahụ, e nwere iju oyi na agha a na-ebu n'ụfọdụ ebe ka e nwee ike kpọlata ha n'udo. Ụmụaka Chibok bụ ndị a tọọrọ n'afọ 2014 alọtachabeghi. Ndị mụrụ ụmụaka kwuru na atọghapurụ ụmụ na ụtụtụ Wenesde. Nna otu n'ime ụmụaka bụ Kundili Bukar gwara BBC na ọ ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram kpọlata ha. O kwukwara na ụmụaka zịkọrọ na ahụ adịghị ha mma. Ụmụaka kwuru na ise n'ime ha nwụrụ mgbe Boko Haram tọọrọ ha makana ụgbọala ejiri buru ha kpachiri akpachi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-45697182,https://www.bbc.com/igbo/media-45697182,APC Primaries: Eyigharịala nke Abia state,Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na eyigharịrị ụbọchị ntuliaka imeụlọ APC n'Abịa steeti makana ndị otu ha si Abuja erutebeghi.,"Otu pati APC Abia steeti agbakọla aka họpụta Buhari maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 Onyeisi otu APC nke Abia steeti bụ Donatus Nwamkpa, kwuputara nke a ka ya na onye ntaakụkọ BBC kwuru n'ekwentị. Ndị APC Abia steeti gbakọtara aka họpụta Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye ha chọrọ ka ọ nọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Ọkammụta Chris Nwamuo gụpụtara aha Buhari ebe ha na-eme ntuliaka imeụlọ taa n'Ụmụahịa, Abịa steeti. Nkechi Nwogu bụ onye omeiwu nọchiteburu Abịa Sentralụ so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara n'ọgbakọ ahụ a nọ kpọpụta aha Buhari. Nwogu bịara ọgbakọ a n'agbanyeghi na ọ naghị azọ ọkwa na 2019 Nyerere Anyim so na ndị isi n'otu APC n'Abịa na ndị ọzọ gbakọtaranụ kwuru na Buhari dị ha mma n'obi, ma kwuo na ọ na-arụ ọrụ a hụrụ anya, sị ka ọ rụrụ gawa n'ihu. Nyerere na ndị otu APC ọzọ chọrọ ka Buhari zọọ ọkwa ọchịchị ọzọ Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na anwụchiela ụfọdụ ndị butere ọgbaghara n'ọgbakọ ntuliaka imeụlọ APC. APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu Na ọgbaghara dapụtara emeghi ka ndị mmadụ kwakọrọ lawa be ha, makana akụkọ kwuru na ntuliaka ndị mmadụ ji maka ya bịa ka ga-aga n'ihu. Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Enugwu steeti ugbua zitere foto a na-egosi na ntuliaka a ga-ebido n'oge na-adịghị anya. Otụtụ ndị nche obodo pụtara maka ntuliaka a. Ndị nche a pụtara n'Enugwu Ndị ga-ebinye aka eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a n'Enugwu APC n'ime Kano steeti ebidola ntuliaka imeụlọ nke ha. Ọtụtụ ndị otu ha apụtaala maka ntuliaka nke taa. Ndị otu APC na Kano Ngwa ọrụ ha ga-eji were mee ntuliaka eruola wọọdụ dị iche iche na Kano maka ntụlịaka imeụlọ a. Ngwa ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a. PDP dị njikere Ọ bụghị sọọsọ APC na-eme ntụlịaka imeụlọ. Ndị otu PDP agbakọọla n'Okpara square ebe ha ga-eme ntuliaka ha. Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu na puku karị puku mmadụ bụ ndị gbakọrọ n'ebe ahụ. Ka o si dị ugbua n'Enugwu, ha ka na-elebe anya n'akwụkwọ ka ha ma ndị ga-eso na ntuliaka nke taa. Ndị otu APC apụtala na ọgbọ egwuregwu Adamasingba n'ime Ibadọn bụ isi obodo Oyo steeti. Ha na-eche mgbe ha ga-ebido ịchọpụta ndị dere aha na akwụkwọ maka ntụliaka a. Ndị Oyo apụụla maka ntuliaka ime ụlọ a N'Abia steeti, ndị otu PDP kwuru n'ịrọ ọgbọ egwuregwu nke Umuahia isi obodo Abia steeti ebe ha ga-eme ntuliaka imeụlọ nke steeti ha taa. BBC Igbo na-ewete ozi na o nwere ndị ji akwụkwọ ikike adigboroja maka ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti. Ha ekweghị ka ha bata n'ebe a na-eme ntụlịaka a. Akwụkwọ ikike adigboroja APC na-akọwa na nke a bụ nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike ntuliaka imeụlọ nke APC. Nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike Akụkọ ka na-abịa." afirika-43792996,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43792996,Na Naijiria ndị ọrụ ahụike ga-agba abụbụọrụ,Ndị ọrụ ahụike na Naijiria gburugburu malitere abụbọọrụ n'abalị Tuusde n'ihi ebubo na gọọmentị etiti ekweghị emezu nkwekọrịta ha nwere.,"Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Isaac Adewole hibere kọmiti maka nchọpụta ọnọdụ ọnụọgụgụ na ahụike ndị najiria akpọrọ 2018 Nigeria Demographic Health Survey (NDHS) na bekee nsonso a Dịka onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike bụ Joint Health Sector Union (JOHESU) n'aha bekee bụ Josiah Biobelemoye, siri kwuo n'akwụkwọ otu ahụ depụtara, ihe butere abụbọọrụ ahụ bụ omume 'ọgbasaghị m' nke gọọmenti na ndị ndu ngalaba ahụike. N'ụbọchị Monde, ha kwuru na ha ga-ebido abụbụọrụ n'abalị Tuusde ma ọ bụrụ na gọọmennt hapụ ime ihe ha chọrọ. Ihe ndị ọrụ ahụike chọrọ ka gọọmentị mere ha dịka Biobelemoye siri kọwaa gụnyere ibuli ụgwọọnwa ndị ọrụahụike, iwe ndị ọhụrụ n'ọrụ nakwa imezu mkpebi ụlọikpe nwere n'okwu ha na gọọmenti etiti nwere n'ibuli afọ onye ọrụahụike na-arụ ọrụ site n'afọ iri isii gaa afọ iri isii na ise. O kwuru na ndị ọrụ ahụike kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara n'ọnwa Septemba 30, afọ 2017 ka ha na gọọmenti tinyechara aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke a kpọrọ, Memorandum of Terms of Settlement (MOTS) na bekee. Dịka o siri kwuo, e kwesịrị imezu ihe nile ekwekọrịtara n'akwụkwọ nkwekọrịta a n'ime izuụka ise ha jiri kwụsị abụbụọrụ ahụ ha gbara na mbụ. O kwuru na ọnwa isii agala kemgbe ha jiri kwusị abụbụọrụ mana gọọmenti emebeghị ihe doro anya banyere ihe niile bụ okwu. Biobelemoye kwuru na n'abalị ise nke ọnwa Febrụwarị, otu ha nyere gọọmenti abalị iri abụọ na otu iji mezuo nkwekọrịta ha nwere. Ọ gara n'ihu kwuo na ha tụkwasara abalị iri atọ ka abalị iri abụọ na otu ha nyere ha gara. Akụkọ ga-amasị gị:" 47073307,https://www.bbc.com/igbo/47073307,Ị ga-enye nwunye gị maọbụ di gị akara akpaego gị dị n'ụlọakụ?,"Di na nwunye na-eriko nri, eyikọ akwa ma na-enwe mmekọrịta mana okwu ego abụghị egwu ụfọdụ chọrọ ị na-agbakọ ọnụ.","Ọchị eze di na nwunye ọ n-eru n'okwu ego? BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ma ha ga-enye nwunye ha maọbụ di ha akara akpaego ha dị n'ụlọakụ. Ajụjụ anyị mere gosiri na ụfọdụ ndị nọ na alụmdinanwunye anaghị eji ihe gbasara ego ha akpa ọchị. Luke Chinedu Mmoo kwuru na ọ dị mma dịkwa njọ. ""Ebe ezi ịhụnanya dị, tinyere nkwanyere onye ọbụla ugwu ruru ya, ọ maka. Mana ebe aghụghọ na ọchịchị nke onwe juru n'ezinaụlọ, ọ dịghị mma chaa chaa."" Ezinne Francis kwuru na ọ bụ ụdị di onye nwere ga-ekwu ma onye ahụ aga enye ya akara ụlọakụ ya. ""Ọ bụrụ na ọ bụ nwoke amamihe zuru nke ọma, n'ezie aga m egosi ya ihe niile ma meekwa ka ọ mara na mu na ya bu otu."" ""Mana ya bụrụ nwoke na-añụ oke añụrụma, m gaghị eme ka ọ mara maoli."" N'otu aka ahụ Daphne Uduneje kwuru na ya na di ya na-ekekọrịta ihe niile gụnyere akara ụlọakụ ha. ""O nweghi ihe dị na ya. M chọọ iwere ego, ọ bụrụ na e nweghị m efe, di m na-aga ewetara m ya. Ụfọdụkwa, ana m aga ewetara ya."" "" O nweghi ihe ọjọọ dị na ya ma ọ bụrụ na ha abụọ bụ di na nwaanyị ewezuga ma o nwere ka agwa otu onye n'ime ha dị."" Nwori Matthew kwuru na ""o nweghi ihe m hụrụ jọrọ njọ na ya. Ebe m nwere ntukwasi obi n'ebe nwunye m no, a ga m enye ya akara ụlọakụ m. O buru na m enyeghi ya nwunye m, ọ bụzi onye agbataobi ka m ga-enye ya?"" Mana Matthew gbara ama na ya alụbeghi nwaanyị." afirika-43073711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43073711,E mela Ramaposa onyeisiala mba South Africa,Onyeisiala ọhụrụ ahụ bụ sọ otu onye akpọlitere maka ọkwa ahụ n'ụlọ omeiwu a ma jiri ukwe na ọṅụ nabata ya n'ụbọchị Tuesday.,"Cyril Ramaphosa bụbu osote onyeisiala mba South-Africa Bolaji Akinyemi , onye bụbu Mịnịsta Naijiria na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ ekwuola na aka mgba na-eche Ramaphosa bụ onye nọchiri anya Zuma nke South Africa. Akinyemi bụkwa onye ọkammụta n'ihe gbasara ihe na-eme na mba ndị ọzọ kwuru na ọ dị ọtụtụ olulu ga-echere Cyril Ramaphosa aka mgba dịka ọ na-abanye n'ọkwa onyeisiala. Na mkparịtaụka ya na onye ntakụkọ BBC, Akinyemi kwuru na ntuliaka ememe ikpeazụ na mba South-Africa ebe Ramaphosa jiri obere ihe were merie, kewara ANC ebe ọ dị ukwuu. Akinyemi sịrị na-etu o siri dozie esemokwu dị na ANC ma kpa udo ga-ekwu ma ọ ga-eme nke ọma. O kwukwara na e nwere ọtụtụ ndị nwere agba nọ na otu pati ANC na ndị anọghị ya bụ ndị eboro ha na Zuma ebubo mmerụaka bụ ndị nwere ike ichere ya aka mgba. Ọzọ dịka ibe, Akinyemi kwuru na Ramaphosa bu ebubo dị icheiche bata n'ọkwa ọhụrụ a nke gụnyere ebubo mmerụaka na igbu igbuọtụtụ ndị mmadụ na Marikari. "" Africa agaghị enwelata mụọma dịka onye ndụ. ọ bụ ka ọsị hazie aha ya n'ọchịchị ga ekwu ma ọ ga-achị nke ọma."" ""Ọzọ bụ akụnaụba nke mba ahụ. nke nwere enweghị ọrụ ruru pacent iri abụọ na ise.""" afirika-50985233,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50985233,World War 3: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ,Ogbugbu mba Amerịka gburu onyeisi agha mba Iran bụ Qasem Soleimani na mba Iraq akpaliteela egwu ma ọ ga ebute agha Mbaụwa nke atọ.,"Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia n'arụ aka na ọ bụ ụdị ekweghị ekwe ụfọdụ mere mmiri jị banye opi ụgbọgụrụ nke butere agha abụọ ahụ. Lee ụfọdụ ihe ndị mere n'agha abụọ ahụ: Agha Mbauwa Mbụ (1914-19) Uwa niile enweela nkpebi na udi agha agaghị amalite ọzọ Ndị lụrụ ya: Agha mbaụwa Mbụ bidoro n'etiti mba Briten na mba Jamini n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1914. Mba Briten,Fransi na Russia kwụkọtara luso Jamani na Austria-Hungary na ndị na-akwado ha. Ihe butere okwu: Ọ bụ ịzọ onye ga-ewere obere mba ndị ọzọ bụ ihe butere ụka. Oge ahụ ndị mba nwere agba dịka Briten,Russia na Jamini na-azọkọsị obodo ha ga-eweghara ọchịchị ha(colonies). Jamani na Austria-Hungary weghara mba Bosnia na Morocco nke were mba Briten Iwe ha were si na Jamini ji anya ike achụ ya bụ ihe. Agha Mbauwa Abụọ (1939-1945) Adolf Hitler bụ onyeisiala chiburu mba Jamanị chọrọ igbochapụ ndị Juu n'elu ụwa a Ndị lụrụ ya: Na mbụ naanị Briten na Fraansi bụ ndị nọ n'ọgụ ahụ Hitler kotere. Mana mba Amerịka sonyere n'agha ahụ oge mba Japan wakporo Pearl Harbour. Ogbunigwe Amerịka tụrụ na Hiroshima n'abali isii nke ọnwa Aụgụst afọ 1945 mere ka Japan chilie aka dịka onye e meriri emerị. O bụ n'agha ahụ ka Hitler gbalịrị ikpochapụ ndị Juu niile. Ihe butere okwu: Agha Mbaụwa nke Abụọ dara dịka Adolf Hitler wakporo mba Poland n'abalị mbụ afọ 1939. Mba Briten chere ha aka mgba ka abali abụọ gachara n'abalị nke atọ nke Ọnwa Septemba. Agha Mbaụwa Mbụ na Nke Abụọ kpara mkpa mkpa dịka o butere agụụ,mbibi akụnaụba ma takwaa isi ọtụtụ mmadụ. Nke mere mba lụrụ ya jiri nwee nkweọkrịta na ha agaghị alụkwa agha ọzọ. N'agbanyeghị na a lụghị agha abụọ ndị a n'ala Afrịka mana ndị mba ofesi ndị nwere ọchịchị n'ala dị n'Afrịka dịka Naijiria dọrọ ụmụ afọ Afrịka gaa lụọ ya bụ ọgụ." afirika-53577872,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53577872,Etu m si chọpụta na George Obinna Floyd bụ nwafọ Mbaise - Humble Okoro,Ụkọchukwu Humble Okoro nke ụlọụka Joy Christian Church dị na Pọtakọt akọwala ihe mere o ji ligharịa George Floyd bụ onyeisi ojii ndị uweojii gburu n'Amerịka n'ọnwa Mee.,"George Floyd si n'agbụrụ ndị agha Mbaise gara Amerịka Ụkọchukwu Okoro hazigharịrị akwamaozu George Floyd n'obodo Umuoffor dị n'Obokwu Obibi Aboh Mbaise nke Imo Steetị. Ọ gwara BBC Igbo na George Floyd si n'agbụrụ otu nwoke Mbaise mụrụ otu nwa ma kpọrọ ya gaa Kameroon, si zie ebe ahụ gawa mba Amerịka ga biri. Ọ sị na nke a si n'akụkọ a kọrọ ya tinyekwara na ị bịa n'obodo Umuoffor Obokwu na e nwere ọtụtụ ndị gbara dimkpa yiri George Floyd. Ọ sị na nyocha o mere gosiri na George Floyd bụ onye agha si Mbaise nwụrụ n'Amerịka na ọ bụ ya mere o ji kpọọ aha ya ""George Obinna Floyd"". Ụkọchukwu Okoro sị na ọ ga-akpọ oku ka eme nyocha 'DNA' iji mata kpọmkwem na George Obinna Floyd bụ nwafọ Umuoffor Obokwu Mbaise. Ọ sị na obi dị ya ụtọ na ha eligharịala ""George Floyd Obinna"" n'akụkụ ndị nna nna ya ochie. N'ọgbakọ Akwamozu a, edosara igbe ozu e biri foto ""George Floyd Obinna"" n'elu ya, ebe ụfọdụ ndị nwoke na nwaanyị yi akwa ojii dịka ndị na-eri uju nọkwa ebe ahụ. Cheta na e liri George Floyd n'Amerịka n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun, afọ 2020. Mana otu nwoke a kpọrọ Sam Anuka bụ onye obodo Ufoama Obibi Ngwu sị na ọ maara ezinaụlọ ụkọchukwu Humble Okoro nke ọma. Na Okoro bụ onye obodo Obokwu Obibi Ngwu, na ọ bụ onye ụkọchukwu otu ụlọụka ọgbara ọhụrụ dị na Pọtakọt. Anuka sị na Okoro na-eme ihe nkiri na ọ bụ ihe nkiri ka a sị na ọ na-eme maka olili George Floyd na ọ bụghị ezi akwamozu. Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd Ihe ndị mmadụ na-ekwu @KinyanBoy sị na e nwechara ndị na-ebe akwa n'ebe ahụ. @EniolaJeremy jụrụ sị na mgbe i chere na ị hụchaala ya, Naịjirịa ga-abụta zi gị nke tọrọ Biati @daisythemogul sị na ndị Igbo na-aghọ aghụghọ Akụkọ ka na-abịa..." afirika-48319450,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48319450,Buhari: Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọsọ onyeisiala gbara na Makkah,Ọtụtụ ndị hụrụ ebe onyeisiala na-agba ọsọ na Makkah kwuru ọtụtụ ihe gosiri na obi dị ha ụtọ na Buhari siri ike nke ịgbakwu ọsọ.,"Ihe onyonyo a bụ onye nta akụkọ NTA sere ya gosiri Buhari ebe ọ gbapụrụ ọsọ dịka omenaala ekpere alakụba si nye n'izu a. Ọtụtụ ndị kwụnyere Buhari kwuru na ọsọ a ọ gbara gosiri na okwu niile na-afegharị maka adịghị ike ya bụ ụgha. End of Twitter post, 1 @unclexofficial tinyere ihe onyonyo a n'akara twitter ya ma na-etokwa onyeisiala Buhari. @aoroh kwuru na ndị mmadụ ekwesịghị iji ihe gbasara okwukwe onye na-ekwu okwu. @cbngov_akin1 kwuru na nke a gosiri na Buhari dị sam. Mana ndị a na-ekwu ihe ọzọ. @Talibkolo1 kwuru naekwesịghị iji ọsọ ahụ tunyere etu Buhari ga-esi hazị akụ na ụba Naịjirịa. @SenGoodluck rịrịọ ka onyeisiala Buhari kpere ụmụ Naijira ekpere. Mana o nweghị ihe dị njọ ma ọ bụrụ na onyeisiala bụrụ onye ekpere makana ọ ga na-ekpere obodo ya ekpere." afirika-47038735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47038735,Igbo Language: 'Akuzierela m ụmụakwụkwọ karịrị otu nde asụsụ a',Ọtụtụ ụmụ Igbo na-ekwu na ịmụta asụsụ Igbo siri ike.,"Mana onyenkuzi Rose Usoh kuzierela Igbo kemgbe afọ iri abụọ na abụọ kwuru na o nweghị onye kuziri ya etu esi asụ maọbụ etu esi ede asụsụ Igbo. O kwuru na ugbua, na ọ kuzierela ụmụakwụkwọ ruru otu nde na ụma etu e si ede ma na-asụ asụsụ Igbo site na akwụkwọ ọgụgụ o derela. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45716145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45716145,Buhari asaala nwunye ya okwu?,"N'ime akwụkwo ozi Buahri deputara site n'onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, o kelere ndị mmadụ maka nkwado ha nyere ya.","Ọ gwara ndị mmadụ na n'ime asọmpị ọbụla a na-enwe ndị mmeri na ndị emeriri. O kwukwara na ọ dịmma ka ndị emeriri nabata ya n'ebughi ihe ọjọọ ọbụla n'obi ha. N'ọnụ ya ""ṅomie nu Ambode onye apụghị na patị n'agbanyeghị na emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ steeti ya"" Ọ gwara ndị meriri ha gba mbọ jiri ọkwa ha mee ka ndụ dịrị mmadụ niile mma. Cheta na nwunye ya bụ Aisha Buhari wuru ewu n'ụtụtụ a maka nkatọ ọ katọrọ usoro eji azọ ọkwa ọchịchị. Muhammadu Buhari nwetara vootu ruru 14,842,072 Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole bụ onye kpọpụtara aha onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ha na ọgbakọ ukwu pati ahụ nwere n'Eagles Square, Abuja. Buhari nwetara vootu 14,842,072 bụ ọnụọgụgụ otu ahụ aha ha dị n'akwụkwọ pati ahụ,ebe ndị nnochiteanya biara ọgbakọ ukwu ahụ dị mmadụ 7,000. Okwu nnabata Buhari N'okwu iji nabata mkpọpụta ahụ, Buhari kerele ndị isi pati ahụ, ndị nhazi ọgbakọ ahụ,nakwa ndị hapụrụ ya ọkwa ahụ maka ọdịmma nke pati ha. Ọ gụkọrọ ihe ọma niile ọchịchị ya merela kemgbe 2015`nke ọ gụnyere ibu agha megide nrụrụaka, imeri Boko Haram na ịrụ maọbụ irụzị okporoụzọ, ma kwe nkwa mmeri na 2019. ""Obi dị anyị mma na ihe ndị anyị merela site na afọ 2015 rue ugbua. "" Anyị agbala mbọ iweghazị ọnọdụ nchekwa na akụnụba Naijiria na-emilabu. ""Nsogbu Boko Haram ebelatala. Udo aloghachiela na Ugwu na agbataobi anyịọ na mba ndị ọzọ eze ha na-akpabu ike. ""Ego dị n'akpa anyị agbalitela ruo Ijeri dọlaza 44 nke ka ihe anyị kwudoro na 2015. ""Ọkụlatrik nọzị na 8000megawat ebe ọ bụbu 4600 megawatt."" Mmadụ naanị maadụ puku asaa binyere aka na ntuliaka Ndị otu APC na-aghazi ebe ndị ga-atụ vootu ga anọ Ọ bụghị naani otu pati na-eme ọgbakọ ukwu ha taa, otu APC ga-emekwa nke ha n'abali ụbọchị isii nke ọnwa October . Ọ bụ mmadụ ruru puku asaa ga-ebinyeaka n'akwụkwọ ntuliaka imeụlọ a. Naani otu onye na-azọ oche onyeisiala n'ọgbakọ ukwu APC. Aha ya bụ Muhammadu Buhari. Ebe a bụ ebe ndị Enugu APC ga-anọ Ụfọdụ n'ime a nọrọla ebe a na-eme ya bụ ntuliaka bụ Eagles square dị n'Abuja. Paul Ikonne bụ otu n'ime ndị chọrọ ịzọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru APC n'Abia steeti ekwuola na nrụrụaka abanyela n'usoro ntuliaka imeụlọ ha. O boro ụfọdụ ndị pati ebubo na ha denyere aha ụfọdụ ndị esoghi n'awkụkwọ ndekọ ha ji si Abuja bịa. Usoro ntụliaka a ezighi ezi - Paul Ikonne N'ime ndị ọ kpọrọ aha mere mpụ a bụ Orji Uzor Kalu bụ aka chịbụrụ Abia steeti. Onyeisioche APC na Abia steeti Donatus Nwamkpa kwuru na ọ bụghị ya ga-asa Paul Ikonne, na ọ bụ onye ndu komịtị ehibere maka ntuliaka a ga-asa ya okwu. Kedụ nkewa nke na-ekwu eziokwu n'APC Imo steeti? FCC Jones bụ onye odeeakwụkwọ mgbasaozi APC n'Imo steeti gwara BBC Igbo na ntụlịaka imeụlọ n'Imo steeti nke a kpọrọ 'Primaries' na Bekee dị njikere ịme taa. O kwuru na a hụbeghị Ahmed Gulak bụ onye kwesiri ịhazi ma nyochakwa ya bụ ntuliaka. N'aka nke ọzọ Theo Ekechi si n'agba ọzọ n'ime nkewa nke dị n'APC kwuru na Ahmed Gulak nke a na-acho achọ arụchala ọrụ dịrị ya laghachi Abuja. Ọnụ na-ekwuchitere Eze Madumere bụ Uche Nworah gwara BBC Igbo na onweghi ntụlịaka ọbụla na-eme taa. O kwuru na n'uche ha, e meela ya bụ ntụliaka ụnyaahụ. N'Abia: Ngwaọrụ atụọla na Abia steeti Ngwaọrụ a ga-eji mee ntụlịaka imeụlọ nke APC n'Abia steeti erutela n'ọgbo ebe e kwesiri iji ya mee ihe. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46748992,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46748992,2019 BUDGET: Kedu etu bọjeti siri metụta steeti ndị n'ala Igbo?,Amụma mkpata na mmefu ego na-abụkari ihe omume omenafọ nke gọọmenti ọbụla n'emekarị iji gosipụta ndị ha na-achị ọrụ dị iche ha ga-abagide na-afọ ahụ.,"Dịka afọ 2019 na-ebiri ọkụ taa, ọtụtụ mmadụ na-atụ anya na gọọmenti steeti dị iche iche ga-agba mbọ itinye amụma mkpata na mmefu ego nke steeti ha dị iche iche n'ọru, iji mee ka ọnọdụ ndị ha na-achị dịkawanye mma. BBC Igbo mere nnyocha iji mara ka ọnọdụ mkpata na mmefu nke afọ 2019 na steeti dị iche iche n'ala Igbo siri dị. Ebonyi Dave Ụmahị, Gọvanọ Ebonyị steeti Dịka onye Kọmịshọna na-ahụ maka ego na steeti Ebonyị bụ Obinna Nwachukwu siri kwuo, Gọvanọ Dave Ụmahị e binyela aka ka ọbụrụ iwu, na bọjetị nke steeti ahụ pụtara Otu Ijeri narị naịra na Iri asatọ na-asatọ na ụma isii (N188.6b) n'ụbochị iri abụọ na anọ nke ọnwa Disemba, 2018. Enugu Ifeanyi Ugwuanyi, Gọvanọ Enugu steeti Na steeti a ka anyị nwetara akụkọ na mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ pụtara Otu Ijeri narị naịra na Itoolu (N109b) ka bụkwa nke nọ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ dịka Kọmịshọna steeti ahụ bụ Eucharia Ọfọ siri kwuo. Abịa Okezie Ikpeazụ, Govanọ Abịa steeti Dịka akụkọ si Enugu siri kwuo, gọọmenti steeti a ka na-ele anya na ndị ụlọ ọgbakọ omeiwu nke Abịa steeti ga-eleba anya na amụma mkpata na mmefu ego nke 2019, pụtara Otu Ijeri narị naịra na iri atọ na itoolu (N139b) na mgbe adịghị anya. Imo Rochas Okorocha, Gọvanọ Imo steeti Mgbe BBC Igbo kpọrọ onye Kọmịshọna steeti ahụ na-ahụ maka ego bụ Oriakụ Ugochi Nnanna-Okoro, ọjụwara isi inye nkọwa gbasara ọnọdụ mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ nke afọ 2019. Anambra Willie Obianọ, Gọvanọ Anambara steeti Mbọ niile BBC Igbo gbara ịkpọtụrụ onye Kọmịshọna na-ahụ maka ego na steeti ahụ bụ Ifeatụ Onejeme, n'ekwe ntị, bụ nke kụrụ afọ n'ala n'ihi na ọzaghị oku ekwe ntị ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-50515749,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50515749,"Zubby Michael: I nye Odumeje otito Chukwu, Chukwu eweere gị iwe","Onye ejije a ma ama bụ Zubby Michael zutere BBC Igbo n'ogige ""Gịnị na-afịọ"" were tinye ọnụ n'ihe banyere ejije na etu o si malite njem Nollywood ya.","Ọtụtụ ndị sonyere n'emume Gịnị na-afịọ jụrụ Zubby mmekọ ya na ụkọchuwu Odumejeje nwere. Zubby kọwara na ya kwenyere na Chukwu mana ya ekweghi n'ụka nke ya ji aga ụka kama na ọ bụ ọyị ka ya na ụkọchukwu Udumeje bụ. Content is not available End of Facebook post, 1 O kwuru na ya matara ụkọchukwu ahụ kamgbe mana ọbụghị na ya na-aga ụka ya. N'okwu ya, ""Ama m chukwu, mana ihe mmọnwụ pụtakwa, agbapụta m."" Ọ sị na ya ekwesighi ịhapu omenala makana omenala bu ihe e ji mara mmadụ. Vicky Nwogu Zubby kwuru na ya anọghị n'Ọnịcha oge mkpa mkpa kpara n'ahịa Ọchanja mana ya gbatara ha ọsọ enyemaka were nye ha otu nde naira ma kwado kwa atụmatụ gọvanọ Obiano wepụtara maka igbochi ọku ọgbụgba n'ọdị n'ihu. ""I nyere ndị mmadụ aka, onwe gị ka i nyere aka."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na o nweghikwa onye e nyere ego sị ya dobe. Maka ndị chọrọ ịbanye ogige Nollywood, Michael sị na ọ dịghị mfe mana ka ha jisie ike, na-emesi ihe ha na-eme ike. O kwukwara ka ndị Igbo ghara ịhapụ asụsụ Igbo makana ọ bụ asụsụ nna nna ndị Igbo. ""Onye hapụrụ asụsụ Igbo obi ndị ichie agaghị adị mma n'ebe ọ nọ."" Maka nwoke iyi uwe nwaanyị, Michael sị na ọ bụghị ihe na-amasị ya mana ya na-ahụ ya na ndị mmadụ nwere ohere ime ihe ha chọrọ ime. Maka ọchịchị, ọ sị na ụdị nke ọ chọrọ abụghi ka ndị mmadụ na-ekwe oke nkwa. ""Ya bụrụ sọsọ ọkụ ka onyeisiala mere n'ime afọ anọ, ya mee ya, ọ bụghi ikwe oke nkwa a naghị emezu emezu."" O kwenyere maka ihe a na-ekwu na a na-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa mana ọ sị na ha bụ ndị na-agba mbọ. ""E mechiri ""border"" bụ ebe ụmụ anyị si ebubata ihe. Mana, ya bụrụ nke ga-eme ka ihe dị mma, ana m akwado ya."" Akụkọ ga-amasị:" afirika-52559194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52559194,Coronavirus in Enugu: Anyị na-akwụsị ndi chọrọ iso ụgbọala bu nri bata ọwụwa anyanwụ - Uweojii Enugwu steeti,Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na enweghi ndị na-esi n'okeala ha ezubata ndị mmadụ si steeti ọzọ dịka kepu kepu na-efegharị kwuru.,"Ndị uweojii nwụchiri gwongworo bu ndị mmadụ si ugwu abata Legọs n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC Igbo na akụkọ na ndị mmadụ na-esi n'Ugwu abata steeti ha abụghị eziokwu n'ihi na ha ekechichaala okeala ha dịka o kwesịrị. O kwuru na ha nweburu ya bụ nsogbu mgbe ndị ha na Enugu nwere okeala na-emechibeghi okeala nke ha, kama na ugbua Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a kwụsị njem isi n'otu steeti fere n'ọzọ, na ndị nke ahụ ekechiwekwala oke nke ha. Mana ọ bụ ebe ahụ ka okwu a kwụsịrị? Ndukwe kwuru sị na ihe ha na-arịa ugbua bụ ndị mmadụ na-awa ụzọ n'ime ọhịa ka ndị mmadụ nwee ike jiri ụgbọala ha zopu ebe ndị uweojii na-echekwa okeala, ka a ghara ịhụ ha. O kwuru na ha ga-achọta ma mechikwaa ụzọ ndị ahụ n'oge adịghị anya. Gịnị ga-eme ndị na-ejighi akwụkwọ ikike ma rute n'okeala? Ndukwe gwara BBC Igbo na ha na-achụghachị ndị ekwesịghị ịbata n'obodo ruru nso oke ahụ, ma kwukwaa na Kọmishọna uweojii nke Enugwu bụ Ahmed Abdulrahman na-agarukwa ebe ahụ ịhụ etu ndị otu ya si echekwa okeala ndị ahụ. O kwuru na Abdulrahman na onwe ya nyekwara ndị uweojii iwu ịnwụchi ndị ọbụla a hụrụ bu ụgbọala na-abụghị ụdịrị e ji mara ndị Enugwu, ka e nwee ike nyochaa ha mara ebe ha si bịa na ihe ha chọ bịa. Mana gịnị na-ebute okwu a na soshal midia? Akụkọ na-efegharị etu e si anwụchi ụgbọala dị iche iche bu ndị mmadụ si ugwu Awụsa abata mpaghara dị iche iche. Ụfọdụ ndị kwuru na etu a Enugwu na Kogi steeti nakwa Benue steeti si nwee okeala, na ọ bụ ebe ahụ ka gwongworo ndị a hụrụ bu ọtụtụ mmadụ si bata. Ndukwe gara n'ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rube isi n'iwu gọọmentị ma hapụ ime njem si n'otu steeti fere na steeti ọzọ. Mara na Enugwu na steeti ndị gụnyere Benue, Kogi na Abịa nwere oke." afirika-47656071,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47656071,Education in Burundi: Ụmụaka atọ agaala mkpọrọ maka isekasi ihe na foto onyeisala,Ụmụagbọghọ atọ agaala mkpọrọ maka ihe ha sekasiri na foto onyeisiala Burundi n'akwụkwọ.,"Ụlọikpe ahụ kwuru na ha so n'ụmụ akwụkwọ asaa anwụchiri na mpaghara Kirundo province n'izu ụka gara aga mana a hapụrụ anọ n'ime ha. Ihe ndị mmadụ na-ajuzi ugbua bụ, ọ bụ maka isekasi ihe n'ihu foto onyeisiala a chupkuru ụmụaka atọ a mkpọrọ? Ụlọikpe kwuru na ha kparịrị onyeisiala Nkurunziza site n'etu ha si sekasie ihe n'ihu dị n'akwụkwọ ha ji agụ akwụkwọ, O kwuru na ọ bụ ya ka ha ga-eji nọrọ na mkpọrọ ruo mgbe a ga-akpọpụta ikpe ha n'ụlọikpe. Ha nwereike ịnọru afọ ise maọbụrụ na ikpe mara ha n'okwu a. Akụkọ na-ekwu na nke a abụghị nke mbu udiri ihe a na-eme. N'afọ 2016, ụmụaka iri na otu gara mkpọrọ maka etu esi bo ha ebubo na ha sekasiri ihe na foto Nkurunziza dị n'akwụkwọ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-46357103,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46357103,AWCON 2018: Falcons anyụọ Bayana ịkpakwụ,Mmeri Super Falcons meriri otu Bayana Bayana nke South Africa emeela ka ha bute iko nke itolu (9) n'asompi AWCON.,"Ka nkeji 90 agbazuru bọọlụ, enyekwara ha nkeji iri na atọ ọzọ mana onweghị onye nyere goolu. Nke a mere ha jiri gbaa penariti bụ nke ndị Super Falcons ji gbajie ha aka napụ ha ya bụ iko ka ha nyere goolu anọ ebe South Africa nyere atọ. Nke a bụ ugboro 11 agbagoro egwuruegwu a. Naịjirịa jide itoolu ya ebe Equatorial Guinea ji abụọ ndị ọzọ. South Africa azọọla iko a na-agba nke ikpeazụ ugboro anọ na-achitaghị aja. N'ime ugboro anọ ahụ, ha na Naịjirịa agbaala ugboro abụọ bụ nke Naịjirịa merichara ha. Abịa n'otu ụmụnwaanyị gbara asọmpi nke 2018 a, ihe karịrị ọkara n'ime ha na-agba bọọlụ na mba ofesi, ebe ndị ọzọ na-agba bọọlụ na Naịjirịa. N'ime otu a sokwa gaa, a kpọrọ aha mmadụ anọ n'ime mmadụ 15 nwere ike inweta ihe nrite ""Nwaanyị kacha agba n'Afrịka"" nke 2018. Onye nchịkọta otu Falcons bụ Thomas Dennerby, sokwa na mmadụ ise nwere ike inweta ihe nrite ""Onye nkuzi kacha akuzi"" nke 2018. Ndị egwu Oparanozie: Anyị na-ekpere Super Eagles ekpere Ndị oche goolu 1) Tochukwu Oluehi Oluehi na-eyi uwe e dere 1, na-eche goolu na Rivers Angels dị na Rivas steeti na Naịjirịa. A mụrụ ya n'afọ 1987. Tochukwu Oluehi echeerela Naịjirịa goolu ihe ruru afọ asatọ 2) Christy Udogadi Ohiaeriaku Ohiaeriaku na-echere ndị Confluence Queens dị na Kogi steeti goolu. A mụrụ ya n'afọ 1996. 3) Chiamaka Cynthia Nnadozie Nnadozie na-echere ndị River Angels bọọlụ. A mụrụ ya n'afọ 2000. Chiamaka cheere otu Flamingoes nke Naịjirịa goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa ndị dị afọ 17 n'afọ 2016 Ndị na-agba n'azụ 4) Onome Ebi Ebi na-eyi uwe e biri ise n'elu, na-agba bọọlụ na Henan Huishang dị na mba China. A mụrụ ya n'afọ 1983. 5) Osinachi Marvis Ohale Ohale na-eyi uwe e biri atọ n'elu, na-agba bọọlụ na Vaxjo DFF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1991. 6) Glory Ogbonna Ogbonna na-agba bọọlụ na Ibom Angels dị n'Akwa Ibom steeti. A mụrụ ya n'afọ 1998. 7) Josephine Chukwunonye Chukwunonye na-agba bọọlụ na Asarums IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1992. 8) Ngozi Ebere Ebere na-agba bọọlụ na Barcelona FC dị na mba Spen. A mụrụ ya n'afọ 1991. Ebere so n'otu Super Falcons buliri Iko Mba Arịka n'afọ 2016 9) Faith Ikidi Michael Ikidi na-agba bọọlụ na Piteå IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1987. Faith Ikidi malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2004 10) Sarah Nnodim Nnodim na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti. A mụrụ ya n'afọ 1995. Ndị egwu etiti 11) Ngozi Okobi Okobi na-agba bọọlụ na Eskilstuna United dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1993. 12) Anam Imo Imo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti. A mụrụ ya n'afọ 2000. 13) Halimatu Ayinde Ayinde na-agba bọọlụ na Asarum IF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1995. 14) Rita Chikwelu Chikwelu na-agba bọọlụ na Kristianstand DFF dị na mba Swidin. A mụrụ ya n'afọ 1988. 15) Amarachi Okoronkwo Okoronkwo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa. A mụrụ ya n'afọ 1992. Ndị na-agba n'ihu 16) Asisat Oshoala Oshoala nwetara ihe nrite ""nwaanyị kacha agba n'Afrịka"" nke afọ 2017, ma bụrụkwa onye kacha gbakpuo bọọlụ na neetị n'Iko Mba Afrịka nke 2016. Ọ na-agba bọolụ na Dalian Quanjain FC dị na mba China. A mụrụ ya n'afọ 1994. 17) Desire Ugochi Oparanozie Oparanozie malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2010. O nwetara ihe nrite boot ọlaedo a na-enye onye kachasị nye goolu nke asọmpi AWCON e mere n'afọ 2014. Ọ na-agbara otu Guinamp dị na mba Frans bọọlụ. A mụrụ ya n'afọ 1993. 18) Francisca Ordega Ordega na-eyi uwe 17, na-agba bọọlụ na Washington Spirit dị na mba Amerịka, mana ezigara ya Atletico Madrid na mbinye. Ọ nọchitela anya Naịjirịa n'asọmpi ndị na-agafeghị afọ 17 nakwa nke ndị na-agafeghị afọ 20. O so Naịjirịa bulie iko atọ n'afọ 2010, 2014, 2016. A mụrụ ya n'afọ 1993. 19) Rasheedat Ajibade Ajibade na-agbara FC Robo dị na Legọs steeti bọọlụ. O nwetara ihe nrite ""onye kachasị gbaa ọfụma"" n'egwuregwu Naịjirịa na Kanada oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016. A mụrụ ya n'afọ 1999. 20) Chinwendu Vera Ihezuo Ihezuo na-agbara BIIK Kazygurt dị na mba Kazastan bọolụ. O nwetara ihe nrite ""onye kachasị gbaa ọfụma"" n'egwuregwu Naịjirịa na Spen oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016. A mụrụ ya n'afọ 1997. 21) Chinaza Uchendu Uchendu na-agbara ndị Sporting club de Braga dị na mba Pọtugal bọolụ. A mụrụ ya n'afọ 1997. Onye nchịkọta Thomas Dennerby malitere ịchịkọta otu Super Falcons n'ọnwa Jenụwarị nke 2018. Ọ bụbu onye nchịkọta otu egwu ụmụnwaanyị mba Swidin. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51564857,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51564857,Coronavirus Outbreak: Etu coronavirus si metụta ndụ mmadụ na-abụghị naanị n'ahụike,Ọrịa nkuume a kpọrọ Coronavirus nke malitere na mba Chaịna abụghị naanị ahụike ka o metụtara kama ọtụtụ ihe ndị ọzọ na ndụ mmadụ.,"Kamgbe ọnwa Disemba 2019 Coronavirus pụtara ihe na mba Chaịna, ọ banyela mba iri atọ nke gunyere Ijipt, Amerịka, Fransị na Briten. Ihe karịrị mmadụ puku abụọ anwụọla n'ọrịa a ebe mmadụ karịrị puku iri asaa bu ya n'ụwa niile. Ngalaba ndị ọzọ Coronavirus metụtara N'agbanyeghi na ọrịa coronavirus matụtara ahụike, e nwere ngalaba ndị ọzọ na ndụ mmadụ ọ na-emetụta n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ. Akụnaụba Coronavirus emụtala akụnaụba nakwa azụmaahịa ọtụtụ mba ụwa karịsịa ndị ha na Chaịna na-azụkọ ahịa nke Naịjirịa so n'ime ha. Nke a bụ maka mgbachi ọtụtụ ọdọahịa dị na mba Chaịna iji belata etu ọrịa a si efesasị. Iji maa atụ; Chaịna bụ mba kachasị azụ mmanụ agbidi n'ụwa niile, mana coronaviru mere ka ha belata aka n'ịzụ mmanụ agbịdị. N'otu aka ahụ ụlọorụ, Apple na-arụpụta ekwentị Iphone sị na ọrịa emetụtala ego nwete ha. Egwuregwu N'ihi ọrịa coronavirus a kagbuola ọtụtụ asọmpi egwuregwu ehiwere na mpaghara mbaụwa dị iche iche karịsịa na Chaịna. Egwuregwu ndị a gunyere 'Formulas One-Chinese Grand prix', Asọmpị Golf nke 'HSBC' na-eme maka ụmụnwaanyị, Tenisi, Ọkpọ, Bọọlụ nkata, Họkị, Badmịntịn, egwuregwu ụgbọala (Motorsport) dgz. Mba Chaịna kagbukwara asọmpi itozuoke n'Olympics Tokyo 2020 ga-adị na Japan mana amabeghi maka nke a ọ ga-eme ka a kagbuo Olympics n'onwe ya. Agụmakwụkwọ Kamgbe coronavirus malitere, ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị na mba Chaịna agbachiela n'ihi ụjọ ibute nakwa ibufe ọrịa a. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ mba ọzọ gụnyere ndị Naịjirịa, Gana, Kameruun ka tọrọ na mba Chaịna. Otu nwata akwụkwọ Naịjirịa gwara BBC Igbo na ha anaghị apụta ezi, ọ sị n'obodo Wuhan ha nọ dịka ebe a gbara ọsọ agha. Njem Nleta E wepụ ahụike, njem bụ ihe ọzọ ọrịa coronavirus kachasị metụta na ndụ ndị mmadụ. A machiela ndị mmadụ ịgagharị n'ọtụtụ ebe dị iche iche na Chaịna. N'otu aka ahụ ọtụtụ mbaụwa na ụlọọrụ ụgbọelu dị iche iche amachiela ime njem gaa Chaịna akwụsịla. Nke a metụtara ọtụtụ Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ na-aga Chaịna azụta ngwaaghịa maọbụ ilegharịanya. Agụpụ ndị a dị n'akụkọ a e nwekwara ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ coronavirus nwereike iji metụta ndụ mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-44558259,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44558259,Nwa Jacinda Ardern: Onyeisiala New Zealand amụọla nwa,"Onyeisiala New Zealand bụ Jacinda Ardern amụọla nwa mbụ ya, nwata nwanyị dara 3.31kg n'arọ.","Jacinda Ardern jiri soshal midia qwa ndị mmadụ maka nwa ya Nke a mere Ardern jiri bụrụ nwaanyi nke agba ohụrụ na ụwa nke ugbua mụru nwa ka ọ na-achị mba. Onyeisiala Ardern gara ụlọọgwụ dị na Auckland na ụtụtụ taa bụ Tọọsde, ka o ji abalị anọ gafe mgbe e chere na ọ ga-amụ nwa. Ardern dị afọ 37 ga-ewere izu ụka isii jiri me ọmụgwọ ya. Nke a mere ka onye osote onyeisiala bụ Winston Peters bụrụ aka na-achị New Zealand ugbua. Mana, Ardern kwukwara na a ga na-eme ka ọ mata maka ihe ukwuu banyere ọchịchị, nakwa na ya ga na-agụ akwụkwọ ọchịchị. A mụrụ nwa ahụ n'ọnụ ụtụtụ tata. Onyeisiala Arden mechara gbasa ozi ọmụmụ a na soshala midia ma kwuo na ya na-enye ndị ọrụ ụlọọgwọ ezigbote ekene. N'ozi o zipụrụ, o dere: ""Ama m na anyị na-enwe aṅụrị ka ndị mmadụ mụrụ nwa ọhụrụ, mana anyị na-enye ekele maka ihu ọma niile na ekele ọma ndị mmadụ na-enye anyị. Daalụnụ."" Ndị ndọrọndọrọ ndị ọzọ na-enye ya ekele, ọkachasị onye bụbu onyeisiala New Zealand bụ Helen Clark. Ardern rigoro n'ọkwa ka n'ọnwa Ọktoba nke afọ gara aga, ma kwuo na ọnwa mbu nke afọ na ya dị ime. Aha di ya bụ Clarke Gayford. Ardern gwara ndị ụlọ ntaakukọ Radio New Zealand mgbe ha gbara ya ajụjụ n'afọ a sị: ""Ọ bughị mụ nwaanyi mbụ na-eme ọtụtụ ihe otu ugboro. Ọ bụghị bụ nwaanyị mbu na-arụ ọrụ ma mụọ nwa; ụmụnwaanyị mere ya mbụ karịrị akarị."" Ọ bụ Ardern bụ onye kachasị bụ nwata na ndị chịrị New Zealand kemgbe 1856. N'afọ 1990, Benazir Bhutto mụrụ nwa nwaanyị ka ọ bụ onyeisiala Pakistan, nke mere ya mbụ na ndị ọchịchị onyekwuoucheya. Tata bụkwa ncheta oge a mụrụ Benazir Bhutto." afirika-49585705,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49585705,Robert Mugabe anwụọla n'afọ 95,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na bụ na Robert Mugabe bu onye mbụ chịrị Zimbabwe ka ha nwetere ọchịchị onwe ha awụọla n'afọ 95.,"Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya Ọ nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa dịka ezinaụlọ ha gwara BBC . Mugabe bụ onye ndị agha chụpụrụ n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba 2017, nke mechiri ọchịchị ọ malitere kamgbe afọ iri atọ. Onye odeakwụkwọ n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ya bụ Fadzayi Mahere dere na Twitter ''Laa n'udo, Robert Mugabe"". A mụrụ ya na 21 Febụwarị, afọ 1924 n'obodo a kpọrọ Rhodesia n'oge ahụ. A tụrụ ya mkpọrọ n'ihe karịrị afọ iri na-ekpeghi ya ikpe mgbe ọ katọchara gọọmentị Rhodesia n'afọ 1964. Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa suru kpọm n'ajụjụ ọbụla ndi mmadụ nwere maka ọnwụ Mugabe mgbe gbasara ozi maka ya n'akara Twitter ya. Maazị Mnangagwa bụbụ osote Mugabe tupu achutuo ya n'ọkwa. Nke a dị mkpa makana onwela ọtụtụ oge a na-ekwubu na Mugabe anwụọla, ma o mecha bụrụ asị. Mgbe Mugabe malitere ọchịchị, ọtụtụ mmadụ n'ụwa dum na-eto ya maka etu o si haziegharịa ọnọdụ ahụike na agụmakwụkọ. Ihe kpatara okwu bụ atụmatụ owepụtala iji nakọ ala ọ sị na ndị ọcha nara ndi be ha n'ike. Robert Mugabe - Oge dị mkpa" egwuregwu-51848010,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51848010,Liverpool vs Atletico Madrid: Atletico efopụla Liverpool ka ahịhịa na Champions League,Nke a bụ agba nke abụọ n'asọmpi dị n'etiti Liverpool na Atletico Madrid maka onye ga-etozu ịga n'ihu maka asọmpi Champions League.,Liverpool gbalịrị ike ha mana Atletico MAdrid ekweghị ekwe Ndị Liverpool bu n'obi ịbọgwara mmeri Atletico ji otu ọkpụ goolu merie ha na Madrid n'asọmpi nke mbụ ha. Ọ dị ka nzube ndị Liverpool a ga-emezu dịka Georginio Wijnaldum nyere goolu nke mbụ na nkeji iri anọ na atọ. Liverpool rụrụ ụlọ were biri na'ogige ọnụ postu ndị Atletico n'agba nke abụọ n'asọmpi a. Ndọlị ndọlị ha mịtara mkpụrụ dịka Roberto Firmino ji isi ya kara aka were takaa neetị ndị Atletico na nkeji iri itoolu na anọ. Ndị Liverpool agaghị echefu etu onye na-eche ọnụ poostu ha siri gbanye ndị Atletico bọọlụ n'ụkwụ nke mere ka ha were ohere a nye goolu mbụ ha n'aka Marcos Llorente. Nke a gbara ndị Atletico ume dịka Llorente gara n'ihu nye goolu ọzọ na nkeji otu narị na ise. Ọ bụ Alvaro Morata ji goolu nke atọ techuo Liverpool ihu mgbe ọ fọrọ ọkara ole na ole ka e gbuchie asọmpi a . 47061409,https://www.bbc.com/igbo/47061409,"NBC akụsuola NTA, Channels TV, AIT nakwa TVC maka okwu asị","Ngalaba na-elebanya na mgbasaozi n'ikuku na Naijiria nke a kpọrọ NBC n'ịchafụ achaala ụlọọrụ ntaakụkọ NTA ,Channels TV, AIT nakwa TVC ọkụ maka ịgbasa okwu asị ndị otu APC na PDP n'ikuku.","Onyeisi NBC bụ Malam Is'haq Modibbo Kawu kwupụtara nke a n'Abuja na mkparịaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere ụbọchị Wenezde mana o kwughị ụdị ahụhụ a tara ha. O kwuru na ndị ụlọọrụ akụkọ anọ akwụsịghị ndị ndọrọndọọ ọchịchị ndị dịka ha na-ekwu okwu asị oge ha na-eme achụmta vootu ha. Nema anabatala ụmụ Naijiria 162 ọzọ si na Libya Onye nchịkọta otu gbatagbata gọọmenti etiti, ngalaba nke Legos bụ Idris Muhammed nabatara ndị ahụ n'ọdọgbọelu Murtala Muhammed International Airport, dị n' Ikeja ka o jiri ọkara gafee elekere atọ nke ụtụtụ Wenezde dịka ụgbọelu Libyan Airlines bulatara ha. Ndị ahụ lọtara dị ụmụnwaanyị otu narị,gụnyere mmadụ anọ dị ime., ụmụnwoke iri isii na abụọ. Ka ọ na anabata ha, Muhammed dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị ga-na agbasa ozi njọọ ọ dị ịsị Naijiria gawa mba ofesi na ejizughị akwụkwọ n'ihi oke ihe egwu so ya. Ọ gara n'ihu kọwaa na Nema na otu European Union na-ahụ maka itinye anya ndị chọrọ iji aka ha lọtara onwe ha ebe ha turu aro etu ha ga-esi aga n'ihu n'ọrụ ịkpọlata ndị chọrọ ịlọta. Ụlọikpe mkpegharị akụpụla ikpe akwụkwọ Onnoghen gbara Ụlọikpe mkpegharị ajụla arịrịọ onyeọkaikpe ukwu Naijria akwụsịrị ọrụ n'ike bụ Walter Onnoghen rịọrọ ka akwụsi ikpe a na-ekpe ya na ụlọikpe ọpụrụiche Code of Conduct Tribunal. Ụlọikpe ahụ sịrị na arịrịọ Onnoghen rịọrọ enweghị iwu kwadoro ya. Ndị mba Venezuela na-eme ngaghariiwe N'ofesi ngaghariiwe na-aga n'ihu na mba Venezuela dịka onye ndu otu pati na-anọghị nọ ọchịchị bụ Juan Guado kpọpụtara onwe ya dịka onyeisiala n'izu gara aga. Ngaghariiwe bidoro kemgbe abali iri abụọ na otu ọnwa Jenụwarị ka onyeisiala mba ahụ bụ Nicola Maduro bidochara agba nke abụọ ya dịka onyeisiala dịka ihe isi ike na akawanye njọ na mba ahụ. Onye egwu Manchester City bụ Rabbi Matondo ahapụla otu egwu ya ga Schalke maka nkwekọrịta ịnọ ebe ahụ afọ anọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56467633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56467633,Igbotic: Lee etu ụmụ Igbo si jri okwu a bụbu akaja akpa nga nga na soshal midia,"''Igbotic'' bụ otu okwu akpụ n'ọnụ ugbu a na Twitter dika ụmụafọ Igbo nọ na ya bụ ogbe nzikọrịta ozi nuputara n'igwe ikwu hooha na ha dị ""igbotic"".","Tupu ugbua, a na-ahụta okwu a bụ ""igbotic"" dika okwu ịkọ ọnụ, okwu ihere ma bụrụ mkparị nyere onye ọbụla akpọrọ ya. Mana ugbua ọtụtụ ụmụaamala Igbo ekwuola n'eze wara wara na nkume a ajụrụ ajụ abụrụla ngalaba ji ụlọ dika ụfọdụ n'ime ha ebipụtala ma yiri akwa edere ''igbotic''. Okwu ""igbotic"" a malitere wuwa ewu na soshal media mgbe nwada Nmesoma Okoye dere na onweghi ihe di njọ mmadụ itinye ireigbo n'okwu,"" kwụsịnụ isị na mmadụ di ""igbotic"" Okwu a kpalitere ọtụtụ ụmụafọ igbo dika ha nyere nzaghachi di iche iche nke gosiri na ha kwenyesisike na ha bụ Igbotic n'ihi na ha bụ Igbo. ndi dika Emeka Amakeze na ndi ọzọ. Cheta na afọ ole gara aga,otu nwafọ Nigeria ama ama n'eti egwu ILBLIZ kụpụtara efere egwu kwadoro okwu a bụ ""igbotic"". ufọdu hutara na onweghi ihe di njọ intinye asụsụ igbo na mkparịta ụka nihi ya ma ọkwa ka akwụsi ikpọ ndi mmadụ igbotic ọtụtụ na nzaghachi kwadoro ka akpọ ha igbotic nihi na bụ nwafọ igbo. ihụtara igbotic dika okwu ikọ ọnụ ka ọbụ eji akpa nganga." 46498958,https://www.bbc.com/igbo/46498958,Sexual Abuse: 'Anyị biacha ekpere onye ọgwụgwọ nsọ edina anyị',Ụmụnwaanyị karịrị iri ekwuputela etu onye ọgwụgwọ nke ime mmụọ nọ na mba Brazil si emetọ ha ahụ ma ha bịa n'ụlọ ekpere ya.,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-agakarị 'ụlọọgwụ ọgwụgwọ nsọ Joao Teixeira de Faria onye a ma dịka ""Jao nke Chukwu"" bi 'obodo Abadiania mana o nwere ọtụtụ ndị nso nso na mba ụwa niile. Onye na-ese esereese bụ Zahira Leeneke Maus onye mba Dutch gwara ụlọ mgbasa ozi akpọrọ Globo TV na Faria họgburu ya ma kwaso ya iko. Faria ji aka ya ba onwe ya ""Jao of God"" N'ime akwụkwọ ozi Faria degara Globo, ụlọ ọrụ ya gọrọ ebubo a eboro ya. Ozi ahụ kwuru na Faria dị afọ iri asaa na isii na-eji ike ya agwọ mmadụ ruru puku ole maọbụ ole mana na-ajụkwa ebubo mmerụaka ọ bụla a na-ebo ya ma ọ na-agwọ ndị mmadụ. O nwere ndị ọzọ na-ekwu udiri ihe a ? Ụmụnwaanyị ruru itoolu na-achọghị ka akpọpụta aha ha agwala ụlọ ọrụ mgbasa ozi Globo na Faria metọrọ ahụ ha ma họgbuo ha na o na-etinye ike idi ọcha na-ahụ ha. Ụfọdụ sị na ha na-achọ ọgwụgwọ obi ọjọ na-eme ha mgbe mmerụ ahụ a mere. Akpọchibuola Faria onye na-abụghị dibia bekee n'ụlọ mkpọrọ ma daa ya nha makana o nweghị akwụkwọ nyere ya ikike ị mee ọgwụgwọ Faria na ndị ama ama Nwaanyị onyonyo ama ama na mba ụwa niile bụ Oprah Winfrey gara njem nleta na Brazil n'afọ 2013 ị hụ Faria ebe ọ na-eme ọgwụgwọ ya n'ụlọọgwụ ekpere ya. Ụlọọrụ mgbasa ozi ABC kwuru na Faria na-ekwu na dibia ruru iri atọ nakwa ndị ọzọ nwereike ị banye ahụ ya ma weta ọgwụgwọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị :" afirika-53762198,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53762198,Chukwuemeka Nwajiuba ekwuola na Waec nke afọ a adịghị iche na nke ndị ọzọ,Chukwuemeka Nwajiuba bụ minista agụmakwụkwọ nke steeti na Naịjiria gwara BBC Igbo na ule Waec nke afọ a adịghị iche na ndị afọ gara aga.,"O kwuru na n'agbanyeghi na ọrịa coronavirus na-akpa mkpamkpa n'ụwa ugbua mere ka ọtụtụ ihe ghara ịga n'usoro e si emebu ha, na enweghi etu ihe si gbanwee ma a bịa n'ihe gbasara ule Waec. N'ihe gbasara nkwado ụmụakwụkwo maka ya bụ ule, Nwajiuba kwuru sị na ụmụakwụkwọ nwere ohere kemgbe ịkwado maka ule a malitere n'ụbọchị Mọnde, 17 nke ọnwa Ọgọst. O kwuru sị na asambodo ndị nke afọ a ga-enweta enweghi etu o siri dị iche na nke ndị lere ule Waec n'afọ ndị gara aga. Maka ndị nke mahadum, Nwajiuba kwuru sị na ndị nọ na klaasị nke ọpụpụ ga-eburịrị ụzọ apụ tupu a malite ịnabata ndị ọhụrụ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a: Ndị mere akụkọ a bụ Sam Agbaje, Ishaq Khalid na Nnamdi Agbanelo" afirika-44092361,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44092361,Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndị ọzọ na-ere codeine,"Nafdac buliri mmachi ha machịrị ndị ụlọọrụ Bioraj Pharmaceutical Limited, Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited ka ụbọchị anọ gafechara.","Ndị Nafdac machiri ụlọọrụ anọ maka nchọpụta BBC mere maka etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine ha na-arụpụta Ha kwukwara na ọrụ nwekwara ike ibido ịga etu o si agabu. Nafdac kwuru na ha na ndị isi ụlọọrụ atọ a zukọrọ n'ụbọchị Tọọsde bụ Mee 10, ebe ha nyochara mmepụta na nkesa ọgwụ nwere codeine nakwa. Onyeisi ndị Nafdac bụ ọkammụta Mojisola Adeyeye, kpọkọrọ nzukọ a ebe ndị na-ahụ maka nyocha na mmezu iwu bụ 'Investigation and Enforcement (I&E)', ndị 'Drug Evaluation Research (DER)' na ndị 'Narcotics and Controlled Substances (NCS)' n'ụlọọrụ ndị Nafdac bidoro ya bụ nzukọ. Dịka ha siri kwuo, ihe ha kpebiri na nzukọ a bụ na ụlọọrụ atọ a ga-ebido ịweghachite ọgwụ ndị nke ha kesasịrị, nke Nafdac ga-etinye anya ịhụ na ọ gara n'ụzọ ziri ezi. Ka Nafdac buliri mmachi a, ha nyere iwu sị ka a kwụsị mmepụta ọgwụ codeine ozugbo ozugbo. Ha kwukwara na ha bụ Nafdac ga-etinye uchu ịhụ na ha mere ihe a gwara ha. Na nzukọ a, Nafdac kwuru na ha agaghị enye onye ọbụla chọrọ ịtụbata codeine akwụkwọ ikike nke bekee kpọrọ 'permit' ruo mgbe ọzọ ha ga-ama ọkwa ya. Ha rikwara ụlọọrụ atọ a iwu ha kwuru ruru iwu ndị ha dara. Codeine, ọtọmegbum" 45937360,https://www.bbc.com/igbo/45937360,Nnamdi Kanu: Israel agọrọla ụkwụ na aka ha gbasara ya,"Ma Izrel, ekwuola na onweghị nkwekọrịta ọbụla ha na Nnamdi Kanu nwere.","Ọnụ na-ekwuru ala ahụ bụ Emmanuel Nahshon gwara BBC na e nyochala akwụkwọ ha ma chọputa na o nweghị onyeọbụlụ dịka Nnamdi Kanu nọrọ n'ala ha ugbua. Ha na-ekwu na ihe nkiri gosiri Nnamdi Kanu n'ala ha nwere ike ibu nke a setere n'oge garaaga. Cheta n'ime ozi Nnamdi Kanu zipuru n'ụbọchị ole na ole garaaga, o kwuru na o si mba Izrel na-ezipu ozi ebe o kwuru na Ipob ka kwusiri ike na ebumnuche ha gbasara ịnweta ala Biafra. Ozi Nnamdi Kanu N'ime ozi Nnamdi Kanu zipuru ọ na-ekwusi ike na ọ bụghị eziokwu na ọ nupuru isi n'iwu oge ya na ndị otu ya na-eme ọgbakọ na bee ya n'ụbọchị ahụ ndị agha biara agha egwu eke. Cheta n'ime ọnọdụ ụlọikpe nyere ya tupu ha atọghapụ ya na mkpọrọ, ha kwuru na o kwesighị ime ọgbakọ ọbụla gbasara Ipob na bee ya n'ala Igbo maọbụ n'ebe ọzọ na Naịjirịa. Mana ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ dịghị n'aka ndị ọchịchị obodo iji ohere zipuo ndị agha Naịjirịa makana okwu a ka dị n'ụlọikpe. Ọ zakwara ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ. M na Nnamdi Kanu ahụbeghị anya Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụzi ugbua bụrụ, gịnị ka Nnamdi Kanu ga-eme ọzọ site ugbua na-aga n'ihu? Onye nyere BBC ikike i were ozi Nnamdi Kanu zisa ụwa bụ Elliot Ugochukwu-Uko. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-52853408,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52853408,Ike Ekweremadu: Ihe mere na okwu 'infectious Disease Bill' agaghị enwe isi,Ike Ekweremadu bụbu osote onyeisi Sinetị Naịjirịa ekwuola na gọọmentị etiti enweghi ikike ịkpachi ego gọọmentị Steeti.,"Ike Ekweremadu bụbu onyeisi ụlọomeiwu Sineti Ekweremadu, kwuru nke a oge ya na 'Dream FM' dị n'Enugwu nwere mkparịtaụka taa bụ Fraide n'ọsịsa ntuziaka ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami nyere sị na a ga-akpachi ego steeti ọbụla nupuru isi n'iwu nnwereonwe ụlọomeiwu steeti nke Onyeisiala muhammadu Buhari binyere aka na nso nso a. Ọ sịrị na ""Ha enweghị ụdị ike ahụ"" ịnapụ steeti ego ma ha nnụpụ isi na iwu nnwereonwe ụlọomeiwu steeti nke onyeisiala Buhari tiri. Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 21 Nke a bụ oge kachasị too ogo e nwerela ọchịchị ndị agbada. Ọ dị mkpa na anyị kwadoro ya ka ọ tọọ atọ. Akwụkwọ iwu maka ọrịa na-na-efe efe(Infectious Disease Bill) Ekweremadu kwuru na akwụkwọ iwu a medigere iwu ala anyị dịka o nye gịghị mmadụ ikike ịga ụlọikpe gbaa ebubo e boro yaọ sị gbasa ikike ịga ebe masịrị gị,inwe ụlọ maọbụ ala."" Ọ sị,""Ọ dịghị ka akwụkwọ iwu maka ọrịa na-efe efe(Infectious Disease Bill) etu o si dị ugbua aga aghọ iwu n'ihi na ọtụtụ ndị omeiwu anabataghị ya."" ""Ọ dị m ka akwụkwọ iwu ahụ dị egwụ karịa ọrịa na-efe efe a chọrọ iji ya gbochie."" Nsogbu Coronavirus wetara n'ọchịchị Iwu ala Naijiria amaghị na ụọ̄ị nsogbu coronavirus nwere ike ịbịa Akụkọ ga-amasị gị" afirika-56016398,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56016398,Spinal Muscular Atrophy: Oluebube mere mgbe anyị na-amụpụta nwa Agaezi- Dọkịta,Dọkịta Emmanuel Chukwuka na-arụ n'ụlọgwụ Odumegwu Ojuwku University Teaching Hospital akọwala udiri ọlụebube mere mgbe Agaezichukwu Joy nwere nkwaru 'Spinal Muscular Atrophy' mụrụ nwa n'ụlọgwụ ha.,"O kwuru na kamgbe o bidoro rụwa ọrụ dibia bekee, ọ hụtụbeghị udiri a. O kwuru na otu ihe gbara ha ume nke ukwu bụ etu Agaezi si were obi ụtọ na ụmeala buo afọ ime ma nabata mkpebi ha na a ga-eji iwa afọ kupute nwa ya nwoke. O kwuru na ihe niile gara nkeọma karịa etu ya ndị otu ya si chee. Amaghị m na nwoke nwereike ile m anya n'ihu ma ya fọdụzie ịtụ ime - Oliver Joy Nwada Agaezichihogeme Oliver Joy nwere nkwarụ kọwara etu ya na ọyị ya nwoke si zute nke o jiri tụwa ya ime nakwa etu o si mụọrọ ya nwa. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Oliver Joy dị afọ iri atọ sị na ọ na nwoke nwereike ile ya anya n’ihu ma ya fọdụzie ịtụwa ya ime maka ngwarụ o nwere. Ọ sị na ya ọyị na ọyi ya nwoke bụ Oshian si na Delta Steetị zutere n'ọbaozi Facebook n'afọ 2020 ma n'ime izuụka ha zutechara ka ọ bịara n'Awka ileta ya. Dịka ha abụọ nọzi ka ọ tụrụ ime ma mụta nwa nwoke kara aka. N'otu aka ahụ, Oshian sị na ọ hụrụ Agaezichukwu n'anya nke ukwuu na o nwere ọ hụrụ n'ime ya nke ọ na-agaghị echefu echefu. Kirie akụkọ ha n'uju: Akụkọ a si n'aka Nnamdi Agbanelo, Ebere Ekeopara na Chioma Obianinwa." afirika-51520265,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51520265,Anambra state: Aka akparala nwanyi ji arịrịọ mere akaọrụ,Aka ndị uweojii n'Anambra akparala otu nwaanyi ji aghọghọ ariọ ego na Orie Olisa dị na Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi.,"Haruna Mohammed bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na ama gbara na ya bụ nwaanyi kpọ ụmụaka abụọ arịọ arịrịo n'ahia na-eme na ya kpuru isi. World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha Nwaanyị ahụ ndị uweojii sị na ọ gbara afọ iri atọ na asaa bụ onye Umuaka dị n'okpuruọchịchị Njaba nke Imo steeti. Dịka Harụna kwuru ya bụ nwaanyị kpọ ụmụaka ụmụnwaanyị abụọ gbara afọ iri na otu (11) nakwa afọ asatọ (8) sicha Imo steeti. Ọ sị na ya bụ nwaanyị gbara ama na ha kwara ndị nwe ụmụaka ahụ na ya ga-azụ ha na-akwụkwọ. Dịka ndị uweojii na-enyocha ya bụ ihe, onyeisi ndị uweojii n'Anambra steeti bụ John Abang na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachara anya maka udi mmadụ ha na-akpọnye ụmụ ha. Ndị uweojii ekwuola nke ha maka mwakpo mere na Delta steeti Ọzọ ndị uweojii na Delta steeti agọọla were sị na ọ bụ nanai otu onye ka ha hụrụ ozu ya na mwakpo nke mere n'okpuruọchịchị Ugheli . Cheta na akụkọ na-efegharị kwuru na gọvanọ steeti ahụ bụ Ifeanyi Okowa sị na aka ndị agha Naịjirịa dị na mmadụ asatọ egburu n'ebe ahụ. Ighalo alọta oyoyo! N'egwuregwu, ahụchatala Odion Ighalo n'isiụlọọrụ ndị Manchester United dị na Carrington dịka ọ nọzuru oge ya n'ebe edowere ya maka nyọcha ọrịa Coronavirus. Cheta na Ighalo nọ na mbibi na Shanghai Shenhua kemgbe afọ 2017 bụ ebe o si abata ugbua. Edowere Ighalo n'akụkụ ebe ana enyocha ya maka Coronavirus kemgbe izuụka abụọ ebe ọ nọ eme ọzụzụ nke ya. Mgbe ajụburu onye nkuzi ndị Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer ma Ighalo a ga-eso sọọ na asọmpi ha nwere na Monde, ọ sị na ya ekwughị otu ahụ mana Ighalo ga-eso ha mee njem ya bụ egwuregwu. Ọ sị na-ekwesiri ịnyetụ ya nwamgbe ka ọnwere ghọtachaa ụkwụ egwu ha na Manchester Untied tupu o soro gbawabọọlụ. Ole siri, ""Ọ bụ Ighalo ka ọ dịara ịgba mbọ sonye n'ihe a na-eme ngwangwa"", Ọchụchụ onye makpuru mmiri Ndị gbata gbata gbatụtụ 'brake' n'ichọta nwoke ahụ Ndị ụlọọrụ gbatagbata Legọs bụ Lasema, agbatụla brake n'ịchọta nwoke chọrọ igbu onwe ya site na isi n'akwammiri 3rd Mailnland maba na mmiri ụnyaahụ. Ndị Lasema kwuru na ihe mere e ji kwụsịtụ ịchọ nwaamadi ahụ bụ maka etu mmiri si adọ ndị makpuru ịchọ ya nakwa ike ọgwụgwụ ji ndị na-achọ ya. ""Ụnụ e mekwala ngaghariwe"" Ụlọọrụ onyeisiala adọọla aka ndị Naịjirịa aka na ntị maka kepu kepu na a chọrọ ime ngagharịiwe gbasara ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa, n'ụbọchị Mọnde. Ozi a si n'ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu, kwuru na ha nụrụ na e goola ihe ruru mmadụ puku abụọ ga-eme ya bụ ngagharịiwe. Enyemaka na-abịara mba Ọstrelia N'ofesi, Puku kwuru puku mmadụ agbakọọla maka emume ndị na-agụ egwu na mba Ọstrelịa ebe a na-atụ anya iji egwu tụkọta nde dọla iri. A na-atụ anya na ego a ga-atụkọta ga-ezu iji nyere ndị bi na mpaghara obodo ebe nnukwu ọkụ ọhịa gbarichara n'ime ọnwa ole gara aga, aka. Aha Kobe Bryant ga-dịgide N'egwuregwu, ndị NBA bụ ngalaba na-achịkọta egwu bọolụ nkata n'Amerịka ekwuola na nturuugo ""onye kacha baa uru"" n'asọmpi nke ndị a ma ama, ga-azawazị aha Kobe Bryant nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu. Mara na oge ọ dị ndụ, Bryant ritere nturuugo ahụ ugboro anọ. Coronavirus ọ nọzị n'ụzọ ụla? Ọrịa Coronavirus na-ada n'ike n'ike N'ofesi, Mba Chaịna ekwuola na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus arịghị elu n'izu a, dịka ọ bụ naanị mmadụ puku abụọ na itoolu bu ya. Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ puku iri isii na asatọ bu ọrịa a na mba ahụ, ebe o gburula mmadụ otu puku na narị isii na iri isii na ise. Mkpu na akwa n'Anambra Ihe mgbawa obi mere dịka mmadụ atọ nwụrụ oge otu ụgbọala kpọnyere onwe ya n'ụgbọala kwụ n'ụzọ n'Amansea dị n'Anambara steeti. Pascal Anigbo bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ndị nchekwa okporoụzọ na steeti ahụ kwuru na mmadụ asatọ merụkwara ahụ dịka mberede a dakwasịrị ụgbọala ahụ si Jalingo na-aga Legọs. Mmmadụ iri atọ na atọ anwụọla na Katsina Ihe ruru mmadụ iri atọ anwụọla dịka ndị omekome bu egbe wakporo obodo Tsauwa na Dankar dị na Katsina steeti. Kọmishọna uweojii nke steeti ahụ bụ Sanusi Buba gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ndị agadị nwaanyị na ụmụaka ka a kacha gbuo n'ihi na ha agbanwughi ọsọ ka ndị obodo ndị ọzọ si mee. Arsenal apịkaala Newcastle ga ụdara Obi bụzi ndị Arsenal pọlịnapolịna Ndị Arsenal ji iwe were sị ndị Newcastle' Anyị abụghị ọgbọ' dịka ha ji ọkpọ goolu anọ were sị ha lawa. Ọ bụ Aubemeyang bidoro ịnye goolu na nkeji iri ise na anọ ebe Pepe, Ozil na Lacazette were goolu nke ha were mezuo ya anọ. Dịka ọ dị ugbua, ha bụzi ndị nke iri na tebulu asọmpị premiership. Liverpool e nwere olileanya? N'egwuregwu, a ka nwere olileanya ichukwude Liverpool n'ọsọ ibute iko Premier League nke bụ mbụ ha ga-ebu ya n'ime afọ iri atọ? Echeghikwa m oo, n'ihi na mmeri ha meriri Norwich n'abalị emeela ka ha jiri pọintị iri abụọ na ise na-aga Manchester City bụ ndị na-eso ha n'azụ. Nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-atọkacha gị ahụ Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko" afirika-43806224,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43806224,Ihe 5 dị n'akpa gị e nwere ike ịkpọga gị nga?,Enwere ike ịnwụchi gị maka ibu mmiri ose n'akpa?,"Ndị uweojii na-ejikarị mmiri ose akwụsị ọgbaghara n'ọtụtụ obodo na gburugburu ụwa Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na mmiri ose so na ngwaọgụ amachiri amachi na Naịjirịa, ya mere na enwere ike ịkpọchi gị ma a hụ ya n'akpa gị. Otu onye akpọrọ @yoitspizzu pụtara na Twitter ịjụ onye na-esote onyeisi ndị uweojii na Legọs bụ Abayomi Shogunle ihe mere eji nwụchie ya n'ụlọọrụ ndị police dị n'Igando maka mmiri ose o tinyere n'ime akpa. Shogunle zara ya sị ya na ihe o mere dị njọ, maka na mmiri ose ahụ bụ 'ngwaọgụ amachiri amachi'. End of Twitter post, 1 Gịnị ka a ga-akpọnwu ngwaọgụ? BBC kpọrọ onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti, o wee kọwaa ihe mere mmiri ose ji bụrụ ngwaọgụ. Oti kwuru na enweghị iwu ọbụla kwuru na mmiri ose dị njọ, mana enwere ụfọdụ iwu a ga-ejinwu jichie onye ọ bụla ji mmiri ose. Ọ sị kwa na onweghị mmadụ ọ bụla nwere ikikere iji mmiri ose n'akpa ha mana ọ sị na mmiri ose dị iche n'anwụrụ ose ndị uweoji maọbụ ndịagha ji arụ ọrụ ha. Oti kwukwara na dịka mkpebi ndị UN siri kwuo, na a ga-akpọnwu mmiri na anwụrụ ose, ngwaọgụ kemịkal. Ị ga-aganwu nga? N'otu aka ihe Shogunle kwuru, kedụ ihe ise nwere ike itinye gị na nsogbu ma ọ bụrụ na ndị uweojii hụ ya n'akpa gị? 1. Mmiri ose 2. Mma 3. Agụba 4. Mkpa 5. Okwute Akụkọ ndị ga-amasị gi:" afirika-48556568,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48556568,Election petition tribunal: Ọkaikpe Garba eburula oche n'ikpe Atiku na Buhari,Ahọpụtala ọkaikpe M.L Garba nke ụlọikpe dị na Legọs dịka onye ga-achabi ikpe ntuliaka dị n'etiti onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar nke PDP.,"Ọ ga-anọchi anya ọkaikpe Zainab Bulkachuwa bụ onyeisi ụlọikpe nkpegharị bụ 'Appeal' na bekee. Cheta na Bulkachuwa sepuru aka n'ikpe a n'ọwa gara aga n'ihi ebubo PDP boro na o nwereike ime nrụrụaka n'ikpe dị n'etiti Buhari na Atiku. Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị Sokoto steeti ozi itiakanobi dịka ndị abalị dị egwu wakporo obodo ise na steeti ahụ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri ise. Ebe ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ anọ echere na aka ha dị n'ogbugbu a. Obodo ebe o metụtara bụ okpuruọchịchị Isa nke dị na Sokoto steeti. Ọgbaghara jupụtara na ntuliaka 2019 - Human Rights Watch Ụlọọrụ Human Rights Watch na-ahụ maka ike ruru onye, kwuru na ọgbaghara na ogbugbu ndị mmadụ ahụrụ na ntuliaka afọ 2019 karịrị akarị. Ha kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ nke ndị agha na ndị uweojii mere ma kpokuo onyeisiala Buhari ka ọ hụ na e chekwara ikike dịrị mmadụ na Naịjirịa. Ụlọọrụ a kwuru na oge ntuliaka ka ndị Boko Haram, ndị ọchị ehi nakwa ndị ohi gburu ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa gbaagburu gburu. Ọzọ, Justice Walter Onnoghen Onyeisiala Muhammadu Buhari anabatala akwụkwọ ezumike nka nke Walter Onnoghen dịka onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ma kelee ya maka ọrụ niile ọrụọrụ n'ala Naịjirịa Cheta na akwụsịburu Onnoghen ọrụ n'ike maka ebubo izochi akụnaụba ya n'ebe gọọmentị nọ. N'akụkọ yiri ya Ogbunigwe agbaala ụgbọala ndịagha Amerịka na mba Naịja dịka ha na-eme ọmụmụ n'ebe ahụ. Mba Amerịka ekwuola na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ ọdachi mana ha nae-eme ndị agha ahụ nyocha. N'egwuregwu, Cristiano Ronaldo na ndị otu ya nke mba Portugal ji otu ọkpụ goolu merie mba Holland iji buli iko n'asọmpị UEFA Nations League." egwuregwu-50227970,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50227970,Chelsea Vs Man United: E ji Chelsea gbụchachaa ọnụ gbụfuo,"Manchester United ji obi ndị Chelsea sie ""maị maị"" dịka ha gbawara ha aka napụ ha ohere ịzọ Iko Carabao.","Goolu atọ e nyere n'ọgbọegwuregwu Stamford Bridge"" ezughị ịkwụsị mmadụ ịpụ n'asọmpi a. Ndị Man Utd bu ụzọ chịrị ọkụ bịa na nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mgbe Marcus Rashford ji penariti dọkaa neetị. Mana Michy Batshuayi bịara saa ya na nkeji 61, nyetụ ndị Chelsea obere olileanya. Na nkeji 73, Rashford gosiri ihe e ji akwụ ya ụgwọ ọnwa, ka o ji mbada ""free kick"" tụkwasị goolu nke kpọnyere ntu n'akpati Chelsea. Goolu a mere ya goolu ise Rashford na-enye Chelsea kemgbe o jiri gbawara Man Utd bọọlụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-44735464,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44735464,A chụọla onye Ndị uweojii gbagburu 'corper' n'ọrụ,"Ndị uweojii n'Abuja achụọla onye otu ha gbagburu Cynthia Angela Igwetu, agbọghọ ji otu afọ efe ala nna ya n'Abuja.","Linda dey only 23-years-old wen she die Kọmishọna ndị uweojii nke Abuja bụ Sadiq Bello kwupụtara nke a oge ọ na-akwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Fraide kwuru na a nwụchiri onye uweojii ganye oge a ga-akpịụpụ ya ụlọikpe. Ụlọọgwụ Garki, nke di n'Abuja, zipuru ozi na-agọ na ọ bụghị eziokwu na ha enyeghi nwa agbọghọbịa ahụ bu mgbọ egbe bịa n'ụlọọgwụ ha ọgwụgwọ. Nwa agbọghọbịa bụ Linda Nkechi Igwetu mechara nwụọ maka ọbara gụrụ ya n'ahụ site n'egbe onye uweojii gbara ya. Igwetu kwesiri i so ndị yipuru uwe ndị NYSC bụ ndị ji otu afọ na-efe ala nna ha ụnyaahụ. Akụkọ dị na soshal midia kwuru na ụlọọgwụ ahụ ekweghi inye Igwetu ọgwụgwọ ma ma ha ahụghị akwụkwọ si n'aka ndị uweojii. Ụlọọgwụ a gara n'ihu sị na nke a bụ nnukwu asị. Lee ihe ha dere na Bekee ebe a: Mana nwanne nwaanyị onye a nwụrụ bụ Chinenye Igwetu gwara BBC na ọ bụ onye uweojii gbara ya egbe n'isi ụtụtụ (elekere atọ nke ụtụtụ) ka ọ na-alọta n'ụlọ ya. O kwụrụ na ọ bụ ka Linda mechiri ọrụ ka ya na ndị enyi ya kpebiri ị ga zuo ike makana ọ fọrọ ọtụ ụbọchị ka ha fechaa ala nna. Chinenye Igwetu sị na onye uweoji gbara ụgbọala bu ha egbe. Ọ si na onye uweojii a si na ya mere nke a maka na ya nụrụ ka mmadụ tiri mkpụ n'ime ụgbọala a, nke mere ha jiri kpebie na ọ bu ndị ntọrọ na-agbafe. Chineye Igwetu sị na ọ bụ naanị nwanne ya nọ n'azụ nwụrụ. BBC gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Anjaguri Manza ajụjụ ịmata ma akụkọ a ọ bụ eziokwu, nakwa onye uweojii aka ya dị n'ihe a. Manza zara sị na ha 'na-eme nyocha maka ihe a"". Cheta na ụlọomeiwu nke ukwu tinyere ọnụ n'okwu a ụnyaahụ." afirika-50032211,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50032211,Boko Haram: 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa.,Ndịagha Naijirịa anwụchiela mmadụ iri ha sị bụ ndị isi otu Boko Haram soro wakpo obodo ndị di na okpụrụ ọchịchị Gwoza nke Borno steeti n'afọ 2014.,"Ndị agha Naijirịa anwụchiela ndị isi otu Boko Haram iri. Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Aminu llIyasu kwuru nke a n'akara Twitter ha na satụde, na ha nwuchịri ndịa n'ụbọchị Tụzde dịka ha na-agba ọsọndụ maka mwakpo ndị agha na awakpo ha na mpaghara Gwoza. Aha ndị a aka kpara bụ ShettimaMustapha Umar, Abba Buji, Alhaji Bukar Madu-(KAHID - Onye Boko Haram ọkwa ya dịka nke 'Brigadier General' ndịagha), Ali Hassan (Ukọchụkwụ ha), Alkali Laminu, Bukur Mustapha, Buba Umaru (Eji 'Black Uhuru' mara) ,Madu Nosobe, Mustapha Hussaine na Umar Jeddum. End of Twitter post, 1 Ha niile si n'ọpkuruọchichị Bama dị na Borno steeti. Nwunye Onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari Ọ gara ezumike na mba Ingland. Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari awuchiela na Naijiria n'ụtụtụ a dịka ọ gara ezumike na mba Ingland. O soro dị ya gaa mba Saudio Arabia maka haji, ebe ha sitere gawa London, Ingland. Ebe ahụ ka ọ nọrọ nwee ezumuike. Ụfọdụ ndi nwunye gọvanọ biakwara sị ya nnọọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdị Azikiwe dị na Abuja. O kwukwara n'akwụkwọ ọ depụtara na ya enwela ike i ji bido ọrụ maka nkwalite ahuike ụmụaka, ndị nne na kwa ndị ọzo na arịa ahụ na Naijirịa. N'Anambra steeti Emume 'World Space Week' n'Anambra Steeti. Mịnịstịrị na-ahụ maka Teknụzu na Naijirịa etoola Anambra steeti dịka ọkachasị n'ihe gbasara Sayencị na Teknụzụ. Ọ bụ mịnịsta na-ahu maka Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu kwụrụ nke a na emume 'World Space Week' ma rịọ ka ụmụakwụkwọ tinye ụchụ na agụm akwụkwọ . N'Ofesi Ndị agha Burkina Faso awuchiela na mpaghara ebe mkpamkpa a kpara Akwa arịrị na-ada na Burkina Faso dịka ndị ana amaghi ndị ha bụ banyere n'ụlo ndị ofufe Alakụba were gbuo mmadụ iri na ise ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ. Onweghị ndị pụtara kwuo na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama a na eche na ọ bụ ndịagha ọgụ Jihad kpara ya bụ mkpamkpa. N'Egwuregwu Ndị nkwadọ Super Eagles ga-apụta n'Agege Stadium mgbe ha na ndị Togo ga-ezute. Ndị otu super Eagles nọ na Naijirịa na-achọ ọkpu goolu atọ ha ga eji gbapụ ndị nke Togo maka Ntozu asọmpị 'African Nations Championship' nke 2020. Ha ga-enwe ohere a na ụbọchị 19 nke onwa oktober na Legos iji bụkwara mmeri ndị Togo meriri ha na be ha. Cheta na ndị otu Togo ji ọkpụ goolu anọ a asatra otu were merie ndị Super Eagles na be ha Ka ọ dị ugbua SuperEagles na achọ goolu atọ ha ga-eji gbapụ ndị Togo na asọmpi a. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma'" afirika-50798887,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50798887,"The Nigerian Nightmare: Lee Kamaru Usman, dimkpa Naịjirịa nwere 'single bone'","Aha mmadụ niile ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ Kamaru Usman, nwaafọ Naịjirịa ji ọgụ eme nri.","Usman kụpụrụ Covington mkpụrụ ụdara n'ọnụ Usman na Colby Covington chịpụrụ ya n'isi ụtụtụ Sonde n'ọgụ UFC. Ha na-azọ mgbanukwu nke 'welter weight' division. Mana Usman ji ọkpọ kụwachaa Covington ọnụ ma maburu ya bụ mgbanukwu lawa. End of Twitter post, 1 Nke a pụtara na ọbụ Usman bụ naanị Eze ga-akwụ ọtọ na ogogo 'welter weight' nke UFC. Mana Covington depụtara n'akara 'Twitter' ya na nrụrụaka dị na mmeri Usman meriri ya. Israel Adesanya na Kamaru Usman, ọkaibe abụọ Naijiria ji eme ọnụ Chetakwa na ọbụ nwaafọ Naịjirịa bụ Isreal Adesanya bụkwa odogwu n'ogogo 'middleweight' nke UFC. Mmeri a na-abịa naanị otu izuuka mgbe Anthony Joshua nwaafọ Naịjirịa tuuru ugo n'ogogo 'heavyweight' maka ndị na-akụ ọkpọ. Joshua meriri Andy Ruiz na mba Saudi Arabia wee nara ya mgbanukwu ọkaibe nke IBF, WBA, WBO nakwa IBO. Anthony Joshua bụ ọkaibe n'ogogo 'heavyweight' maka ndị na-akụ ọkpọ Ruiz meriburu Joshua n'ọnwa Jun, mana n'izu gara aga, Joshua gosiri ya na ọkụ dara ibube anyụghị anyụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya?" mba-uba-43307727,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43307727,Iwobi Nwafọ Naịjirịa abụrụla sinetọ mbụ na mba Itali,Toni Iwobi bụ onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara igwe technụzụ abụrụ sinetọ mbụ nItali bụ onyeisi ojii.,"Toni Iwobi gara mba Itali dịka nwaakwụkwọ A họpụtara ya na ntuliaka e mere na obodo Breshia dị na mpaghara ugwu mba Itali. N'okwu ya, ""Ndị ọyị m, eji m ọṅụ agwa unu na ahọpụtala m dịka sinetọ na Ripọblik! ""Ọ karịala afọ iri abụọ na ise anyị na-alụ ọgụ a chọrọ ibido ihu ọhụrụ!"" O kelere ndị kwadoro ya inweta ọkwa ahụ. Iwobi bụ onye otu pati Anti-Migrant League bụrụ onyendu akụkụ obodo ya n'afọ 1995. Iwobi dị afọ 62 gara mba Itali ihe ruru afọ 40 gara aga dịka nwaakwụkwọ. Ọ lụrụ onye mba ahụ ma bido ụlọọrụ na-ahụ maka igwe mgbasaozi technụzụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-46397129,https://www.bbc.com/igbo/media-46397129,World Environment Day: Ikuku ọjọọ ndị a nwere ike ibute ọnwụ,"Otu United Nation wepụtara ụbọchị taa dịka ụbọchị nchekwa gburugburu ebe obibi nke a kpọrọ ""Beat Air Pollution""","N'akwụkwọ ha wepụtara, ha kwuru na ndị mmadụ ruru nde asaa na-anwụ site n'ikuku ọjọọ kwa afọ. Ụfọdụ ikuku ọjọọ ndị a na-esi n'igwe ọkụ, igwe eji esi nri, ebe a na-ekpofu ahịhịa nakwa ebe mposi dgz. Agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ anwụọla makana ha kubara anwụrụ sị n'igwe na-enye ọkụ, ọtụtụ mmadụ ka na-amụ igwe a n'ime ụlọ ha. N'ime ọnwa Ọgọstụ nke afọ a, otu ezinaụlọ gụnyere di, nwunye na ụmụatọ nwụrụ na Port Harcourt makana a mụnyere igwe na-enye ọkụ n'ụlọ ha. Ọtụtụ mmadu na-eji igwe ọkụ arụ ọrụ Ọzọ mere n'Oshogbo Osun steeti Nọvemba 29, ebe mmadụ atọ n'ime otu ezinaụlọ nwụrụ maka anwụrụ a. N'afọ 2014 ndị ""Good Governance Initiative"" dere na mmadụ ruru puku 100,000 anwụọla n'aka anwụrụ a. Mana ọbụghị sọọsọ anwụrụ sị n'igwe na-enye ọkụ nwere ike imerụ gị nnukwu ahụ n'ime ụlọ gị. Anthony Mgbolu bụ dọkinta gbatagbata n'ụlọọgwụ gọọmentị dị n'Abuja kọwara ikuku ọjọọ ndị ọzọ nwere ike igbu mmadụ Anwụrụ sị ọgwụ anwụnta (Insecticide) N'ọnwa Epurelu nke afọ a, ụmụaka atọ nwụrụ na Gana makana nne ha fere ọgwụ anwụnta ebe a na-ehi ura. Dọkinta Anthony kọwara na ọgwụ anwụnta nwere kemikal dị iche iche mana nke akpọrọ ""Organophosphate"" na Bekee bụ nke kachasị njọ. Mgbolu kọwara na anwụrụ a akpọrọ ""Organophosphate"" jọrọ ezigbo njọ eji ya alụ agha kemikal. ""Otụtụ ọgwụ anwụnta a na-ere n'ahịa ekwesighị ibata n'imeụlọ makana ọ bụ ihe a na-eji egbu anwụnta na anụ ndị ọzọ n'ugbo"" Anwụrụ igwe na-enye ọkụ Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ihe a Mgbolu kọwara na Igwe na-enye ọkụ na-amịpụta anwụrụ akpọrọ 'Carbon Monoxide"". ""Ọ bụ anwụrụ a na-egbu ndị mmadụ makana ọ na-ekupu ""Oxygen"" niile dị n'ebe ahụ. ""Ọ bụrụ na ụbụrụ mmadụ enweteghị 'Oxygen', ọnwụ na-abia n'ike n'ike"", Mgbolu kọwara. Anwụrụ eji esi nri (Cooking gas) Anwụrụ na-agba nnukwu ọkụ Nke a sokwa na ihe nwere ike ịgbu mmadụ. Ọbụghị makana o naghị arịa ahụ ịgba ọkụ mana makana o nwere ike ikusa ikuku oxygen''. Mgbolu kọwara na nwere ike ịnwụ na-erughị nkeji iri maọbụrụ na ụbụrụ enweteghị 'oxygen'. Mmanụ eji ete ụlọ (Paint) Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na mmanụ nwere ike igbu mmadụ Nke a bụ nnukwu nsogbu maọbụrụ na-etere mmanụ a ọhụrụ n'ụlọ. Mgbolu kwuru na onye tere mmanụ ọhụrụ n'ụlọ ekwesighị ibanye yabụ ụlo ruo mgbe isi ahụ ga-apụ. ""Mmanụ a bu ọtụtu kemical na-ekusa oxygen bụrụkwa ihe ndị na-ebute ọnwụ maọbụrụ na ọdịghị n'ime ahụ."" Mmanụ eyere-eye (Bleached oil) Mmanụ nrị Nke a nwere ike ibute nnukwu nsogbu n'ahụ maọbụrụ na ikubara anwụrụ ya n'ime ahụ ruo ogologo oge. Ndị mwere ọrịa Asthma ka nke a kachasị egbu. Dọkịnta Mgbolu kọwara na dịka anwụrụ ndị ọzọ dị n'isi akụkọ a, anwụrụ a na-achụpụ ""Oxygen"" nke na-ebute ọnwụ ngwa ngwa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-44079281,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079281,Ntuliaka 2019: Otu Obasanjo CNM akwadola pati ADC,Otu onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kpokobara nke o kwuru na ọ bụ maka ijikọ Naịjirịa na-abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị abanyela ya bụ ndọrọndọrọ n'ezie.,"Obasanjo bidoro otu ya iji kpota Naíịjirịa Ọ dịka ntuliaka 2019 na ọchịchị Naịjirịa dị Obasanjo n'uche kamgbe dịka otu ya malitere ikwado otu pati African Democratic Congress ADC n'aha ịchafụ. Obasanjo gosipụara nke a ụnyaahụ n'ọbaakwụkwọ ya dị n'obodo ya bụ Abeokuta dị n'Ogun steet. Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ihe o jiri mee nke a bụ ka otu ahụ nwee ike inweta ebumnobi ya nke bụ Naịjirịa ọhụrụ. N'akwụkwọ o dere o jiri kwuo okwu nke ọ kpọrọ isiokwu ya ""Ọrụ m banyere ọdịnaihu ọchịchị onye kwuo uche ya na nkwalite na Naịjirịa"" ọ gwara ndị ntaakụkọ na mkpebi ya bụ iji mee ka otu ahụ nweta ebumnobi ha. N'okwu ya, ""Kamgbe e bidoro ya bụụ otu Coalition for Nigeia Movement CNM n'aha ịchafụ, ọtụtụ n'ime otu pati ruru 68 abịala jụọ otu ahụ maka ịbịakọta ọnụ. ""Ndị ndu ya bụ otu mere nyocha pụrụiche ma jụọ ase dịka ka ha bukwa n'uche ebumnobi nakwa ebe ya bụ otu chere ihu, ha kwekọrịtara ikwado otu pati ADC ịbụ otu ha ga-eso iji weta mgbanwe n'ọchịchị Naịjirịa."" Obasanjo kwuru na ADC dị nkwadebe ma dị uchu iweta ụdị mgbanwe ga-ebuli Naịjirịa elu n'akụkụ niile. Ọ nwalekara ụmụ Naịjirịa ka ha bilie mee ka Naịjirịa dị ike ọzọ. Obasanjo gwakwara ndị omeiwu ka ha sachapụ mpụ na mmerụaka n'ime onwe ha site n'ime iwu ga-emezi Naịjirịa. Ọ chọkwara ka a mezie iwu Naịjirịa ka o nye ndị Inec ikike ihazi ego ndị pati ji achụ nta vootu ebe o kwuru na ya chọrọ ka Inec mee ntuliaka niile na Naịjirịa bido na nke onyeisiala rue na nke ndị okpuru ọchịchị. Ha kwuru na ya bụ otu pati ADC bụ ijikọ aka hụ na ha nyere otu pati nọ n'ọchịchị ugbua bụ APC ọsọ n'afọ 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" 43355300,https://www.bbc.com/igbo/43355300,Na Plateau steeti e gbuola mmadụ 11,"N'ụzụ ụtụtụ ụnyaahụ bụ Fraide 9 ọnwa Maachi, ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gburu opekata mpe mmadụ ise na Miango nke dị n'okpuru ọchịchị Bassa.","Nsogbu Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo atala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Naijiria Ha gbukwara mmadụ isii n'ime obodo Ganda dị na Dafu nke dị n'okpuru ọchịchị Bokkos ndị dịcha na Plateau steeti. Ha gbakwara ụlọ karịrị ụlọ irị ise ọkụ ma merụkwa ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. Nke a na-eme ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari sepụchara ụkwụ njem ọ gara na steeti ahụ ebe ọ gara mepe ngalaba steeti ahụ na-ahụ maka ikpa udo. Ọnụ na-ekwuchitere otu ndị ntorobịa n'obodo ahụ bụ Lawrence Zongo, kwuru na mmadụ ise egburu ebe ahụ gụnyere: Illa Isa Peter bụ onye gbara afọ 52, Henry Audu afọ 25, Emmanuel Joseph dị afọ 16, Christopher Joseph, afọ 16 na Peace Joseph dị afọ isii. Atọ n'ime ndị a bụ ụmụnne nke abụọ bụ ejima. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onyeisi ndị Irigwe Development Association (IDA) bụ Sunday Abdu, gwara ndị ntaakụkọ na Jos, na iihe mere na mwakpo Miango bụ eziokwu. Abdu sịrị: ""Ọ bụ eziokwu na ndị Fulani na-achị ehị gburu mmadụ ise na Miango na mwakpo bidoro n'abali Tọọsde ruo chi ofifo ụnyaahụ(Fraide). ""Ndị ọzọ bụ ndị emerụrụ ahụ na mwakpọ ahụ e nweghị onye chọrọ ha okwu. E bugala ozu ndị ahụ n' ụlọọzụ dị n'ụlọọgwụ. Anyi anaghịzi akụ gbanụgbanụ ili ndị nke anyị egburu. Oge ọbụla anyị kwadoro ili ha, anyị ga-eme ka ndị mmadụ mara. ""Ndị na achị ehi na-egbusịsị anyị mana ọ bụ ha bụ ndị na-ebenụ. Kedụ ụdị agụgọ dị otu a? Anyị na-arịọ ndị ọrụ nchekwa ka ha tinyekwuo uchu n'ọrụ nche iji kwụsị mbibi na ịla ndụ n'iyi na-aga n'ihu."" Otu onye ndu ndị obodo na Bokkos bụ Matawa Mankut, kwetakwara na ihe mere n'obodo Ganda ụnyaahụ bụ eziokwu. Mankut sị: ""Anyị nọ n'ili ozu ugbua iji likọta ndị e gburu. Anyị na-arịọ steeti na gọọmenti etiti ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka iji chekwa ndụ anyị na ihe anyị nwere n'ihi na ndị a na-achọ ikpochapụ anyị."" Ọnụ na-ekwuru otu ndị agha nchekwa nke a kpọrọ 'Operation Safe Haven' bụ Majọ Adam Umar, kwuru na ihe e kwuru mere ma kwukwa na mgbe ndị mmadụ titara ha mkpu akwa na ha mere ngwa nwgwangwa zaa ha oku. Umar kwuru na mgbe ha rutere na ndị mwakpo ahụ agbalagala. Ọ gara n'ihu kwue na ndị agha ewerela ọnọdụ na mpaghara ahụ ma gwakwa ndị mmadụ ka wetara ha ozi ngaghari mmadụ maọbụ ihe na-edoghị anya." afirika-49823056,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49823056,"Exhumed Corpses: Ihe mere e ji bọlie ozu abụọ na Njaba, Imo state",Ụmụ ntoroọbịa eburula ozu mmadụ abụọ abọpụtara maka ịzọ ala bụba n'ụlọ ndị bọrọ ya.,"Nsogbu adaalara ozu abụọ na Njaba Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ikokwu Orlando kwuru na ozu abụọ ndị ahụ nọ na ọba ọzụ dịka ndị obodo na-etinye ọnụ na ya bụ okwu. Orlando gwara BBC na ala ebe eliri mmadụ abụọ ahụ nọ na ndọrọndọrọ tupu e lie ndị ahụ, Ọ sị na dịka ndị obodo na-etinye ọnụ maka ikpezi ya bụ okwu, na dị uweojii kere nkwụcha ị hụ na ọgbaghara agaghị adapụta. O kwukwara na ya bụ okwu abụghị nke ndị uweojii ga-etinye ọnụ ka ọ dị ugbua. Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo chọrọ ịkpọpụ ndị mmadụ n'ụlọikpe. Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ewela iwu ma kwuo na ndị mmadụ na-emetọ aha ya. N'ozi o wepụtara n'akara twitter ya, o kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ na-ebu akụkọ ụgha megide ya. O kwuru na akụkọ ụgha a agbasala na soshal midia niile. Osinbajo sị na ọ ga-ewepu ikike ya dịka onyeisiala iji buso ndị na-emetọ aha ya agha. Ọ sị na o nyela ndị ọkaiwu ya ikike ka ha malite njem ịkpụpụ ndị a n'ụlọikpe. Egbuola otu onye ọrụ enyemaka na Borno Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ Otu ngalaba Boko Haram a kpọrọ 'Islamic State West Africa Province' egbuola otu onye ọrụ enyemaka ha tọọrọ. Otu International charity Action Against Hunger' sị na onye a e gburu so n'ime mmadụ isii ndị Boko Haram tọọrọ n'ọnwa Julaị 2019. Ama agbaala n'isi Trump N'ofesi, eziokwu apụtala ihe ebe ụbụbọ dị n'etiti onyeisiala Trump na nke mba Ukrain bụ Volodymyr Zelensky maka inyocha Joe Biden. Ya bụ ụbụbọ ha kpara na ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Julaị n'ekwentị bụ nke ahụtaburu dịka asịrị apụtala ihe ugbua. Iko CARABOA ebirila ọkụ N'egwuregwu e, Otu egwuregwu na mba Inglandị ga apiri ya na asọmpi iko CRABOA n'abali a. Manchester United na Rochdale, Chelsea na Grimsby, MK Dons and Liverpool, Brighton and Aston Villa so na ndị ga-ezute na mgbede a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Nwoke a saala asịsa kọmishọna ndị uweojii na Rivas Steeti bụ Mustapha Dandaura gwara ndị ntaakụkọ na nwoke eboro ebubo igbu ụmụnwaanyi ise ekwugharịala ma sị na ọ bụ ụmụnwaanyị iteghete ka o gburu na Pọtakọt. Dandaura kwuru na ọ bụ ụlọ ọrịri nke ikpeazụ nwoke ahu gara ka ha setere ya n'ihe onyonyo CCTV ma nwete kwa akara ekwenti ya. O kwuru na ọ bụ ihe ndi a mere e ji jide ya n'ime ụgbọala na-aga Akwa Ibom. O kwukwara na nwoke a kwuziri ugbua na ọ gburu otu nwaanyị na Owerre, Sapele, Aba, Benin na Ibadan ma gbuo iteghite na Pọtakọt. Dandaura sị na ""nke a mere ya iri na ise mere ụnyaahụ dịka ndị uweojii nyocha abụọ si Aba gosiri anyị foto nwaanyị ekechiri aka na ukwu ma tọgbọ n'ụlọ oriri. Ihe onyonyo ha gosiri zipụtakwara nwoke a"" . O gwakwara ndị ngalaba ndị nchekwa ehibere iji hu na ụlọ oriri niile tinyere ihe onyonyo CCTV na ihe ndi ọzọ maka nchekwa n'ogige ha ka ha jisie ike n'ọrụ. Mgbe ndi uweojii mechara nyocha ha, ha ga-akpọpu ya ụlo ikpe. Ọ bụ ụlọikpe ga-ekwu ma ikpe a mara nwoke a. Fetus Keyamo bụ ọkaiwu nwere agba Ebugharịala ọnọdụ Festus Keyamo dịka Minista na-ahụ maka ihe gbasara Naija Delta were mee ya Minista na-ahu maka ọrụ na inweta ọrụ. Keyamo ga-anọchị Tayo Alasoadura ebe Alasoadura ga-anọchi Keyamo dịka Minista Naija Delta. UNGA Buhari kwuru maka ilusa nr uru aka ọgụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ikpe ndị P&ID na-ekpe megide Naịjirịa bụ nrụnrụaka ha chọrọ iji napu Naijirịa ijeri Naira. Buharị kwuru nkea n'ọgbakọ ndị UN na Newyork ma kwuo na gọọmentị Naijirịa na-agba mbo imegide nrụrụaka. N'Ofesi Trump kwuru na ebubo eboro ya enweghị isi Ndị otu ọchichi nke Democrats na mba Amerika ebidola atumatu iji wepu Donald Trump dika onyeisiala Amerika maka ebubo iji mba Ukraine gba onye na-azọsa ya ọchịchị bụ Joe Biden mgba okpuru. Nancy Pelosi onyeisi ndị otu democrats kwuputara nke a kama Trump akpọghị ya ihe. Messi bụ onye ndụ ndi Barcelona Mmerụahụ anapụla Lionel Messi nke Barcelona ohere i so gbachaa asọmpị ebe ha meriri otu boolu Villarel na Tuzde. Ndi otu Barce na-atuanya na mgbe na-adịghi anya Messi ga-abatakwa n'egwu ma mewe ihe eji mara ya. Gụọ akụko ga-amasị gị - Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkịri a Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." afirika-46015559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46015559,APC sị na ọ bụ Igbo nwe onyeisiala n'afo 2023,Akụkọ ndị dị mkpa taa Ndị Igbo nwe onyeisiala na 2023 - APC,"Ndị oti mkpu onyeisiala Buhari na mpaghara ọwụwanyanwụ akatọọla okwu minista na-ahụ maka ọkụ bụ Fashola kwuru na ọchịchị ga-alọghachị ndịda n'afọ 2023. Otu a kwusiri ike na ọ bụ oge ndị Igbo ịhọpụta onyeisiala n'afọ 2023. Ndị ntọrọ ụgbọmmiri ụdịrị ụgbọmmiri a awakporo Ụlọọrụ ụgbọmmiri Swiss ekwuola na atọhapụla ndị ọrụ ya mmadụ iri na abụọ atọrọ n'ihe karịrị otu ọnwa gara aga n'akụkụ osimmiri nke Naịjirịa. Ọzọ gọọmentị mba Poland ekwuola na atọrọla ụmụafọ ha asatọ na mmadụ anọ ndị mba ọzọ nọ n'ụgbọmmiri si Angola na-abịa Naịjirịa. Na mba ofesi, Otu nwaanyị agbagbuola onwe ya n'ogbunigwe ma merụọ mmadụ asatọ ahụ n'obodo Tunis bụ isi ọchịchị mba Tunisia. Minista ime obodo nke mba ahụ kwuru na mmadụ asatọ a merụrụ ahụ bụ ndị uweojii. N'egwuregwu Dịka ọ dị ugbua ndị mmadụ ji ifuru na akwa na-akwanyere Vichai Srivaddhanaprabha ugwu bụ onye nwe Leicester City nwụrụ na mbere ụgbọelu helịkọpta. Ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede a bụ Nursara Suknamai and Kaveporn Punparen na-arụrụ ya ọrụ, Eric Swaffer na enyi ya nwaanyị bụ Izabela Roza Lechowicz bụ ndị ọkwọụgbọ sokwa nwụọ. N'aka nke ọzọ Manchester City ga-ezute Tottenham n'abalịa n'asọmpi Iko Premier. Nkeji abalị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ N'otu aka ahụ, ụgbọelu ọzọ bu mmadụ otu narị na iri asatọ na asatọ dabara n'oke osimiri n'obodo Jakarta dị n'Indoneshia. Otu ụgbọelu Lion (bụ ụlọọrụ ụgbọelu a dabara mmiri ugbua) adababuola na mmiri n'afọ 2013 mana enweghị onye nwụrụ mgbe ahụ. Ndị na-egwu mmiri na Jakarta ebidola ịchọ ndị nọ n'ụgbọelu ahụ, ruo ugbua, ezinaụlọ ndị ụgbọelu ahụ bu na-eche akụkọ ga-apụta na ya. A gụpụtala ụfọdụ ngwongwo ha dịka akpa, ekwentị nakwa ihe ndị ọzọ na mmiri. Nnamdi Kanu Akpụrụla Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu IPOB n'ọnụ ọzọ. Onye ọbụla na-ekwu maka Kanu ka ọ pụtara n'onyonyo ndị mba Izrel ebe ọ gwara onye ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na ndị gọọmentị Naịjirịa ekweghị emezu ihe ndị ọ gwara ha mee, nke gụnyere ịtọghapụ Ibrahim El-Zakzaky nakwa Sambo Dasuki. Anthony Anenih alaa mmụọ Dimkpa adaala ka Anthony Anenih bụ otu n'ime ugwu a na-arị atụ egwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa lara mmụọ. Akụkọ kwuru na Anenih dị afọ iri asatọ na ise nwụrụ n'Abuja ka ọ rịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka. Gụọ akụkọ gbasara Anenih n'uju ebe a: Ihe ise ị na-amaghị maka Tony Anenih N'egwuregwu, Ndị otu Barcelona lụrụ otu Real Madrid dịka nwaanyị na be ndị Madrid ka ha zutere n'asọmpi El-Classico. Luiz Suarez na-agbara Barcelona bọọlụ nyere goolu atọ n'ime otu egwuregwu a Ha ji ọkpụ goolu ise a satara otu (5-1) gwọọ Madrid ịba n'ogige Nou Camp bụ be ndị Madrid. Ihe onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ ""a ga-achụ Julen Lopetegui n'ọrụ?"" Gere akụkọ ndịa n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Tony Elumelu tinyere N1.8m n'ahịa akị oyibo m - Chigozie" afirika-47671286,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47671286,Enugu state: Anyị amaghị ma ndị ọchụehị egburu onye nkuzi mahadum - Uweojii,Ọnụ na ekwuchitere ndị Uwe ojii n'Enugwu bụ Dsp Ebere Amarizu adọọla ndị na-ede ihe na social media aka na ntị,"O kwuru ka ha ghara ịdị na ekwu na ọ bụ ndị Ọchụ ehi Fulani gburu onye nkuzi mahadum Nnamdi Oguche. Amarizu depụtara ozi kọmishịọna Enugwu bụ Suleiman Balarabe ziri were kwuo na ha atinyela anya na mmiri ịchọpụta ndị gburu ya bụ nwa amadị. Ihe butere akụkọ ndị a bụ na ụbọchị wednezde mazi Nnamdi Oguche bụkwazị ode akwụkwọ n'okpuruọchịchị Ụzọ uwani n'Enugwu gara ikpe ala dị na etiti ha na ndị Ezeagụ nakwa ndị Fulani Ọchụehi. Ka mazi Oguche na-ala, ndị ekwuru na ha bụ ndị Fulani kwụsịrị ụgbọala ya ma gbagbunyụọ ya anya. Nkwa dagharịa azọgharịa ọkpa egwu Ọ bụ ya na-eme ugbua n'Osun steeti dịka otu ụlọikpe pụrụiche na steeti ahụ kpọpụtara aha Ademola Adleke dịka onye meriri ntuliaka e mere n'ọnwa september afọ 2018 Cheta na ọ bụ aha Gboyega Oyetola ka Inec kpọpụtara meriri ya bụ ntuliaka. N'otu aka ahụ, Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP bụ Atiku Abubakar ezigarala Ademola Adeleke ụkpa ekele maka akụko a. Oji ohere ahụ kwuo n'ụlọikpe bụ olileanya nke ikpeazụ n'ebe nchekwa ọchịchị onye kwuo uche ya nọ. Ihe mberede okporoụzọ egbuola mmadụ iri isii n'obodo Bono dị na mba Ghana. Ndị uweojii kwuru na ụgbọala abụọ ahụ kụkọtara isi ọnụ nke mere na ọtụtụ ndị niile nọ na ya bụ ụgbọala nwụchasiri. Ha kwuru na ihe a mere elekere abụọ nke ọnụ ụtụtụ n'Anọma Nkwanta dị n'ime ọwụwa anyanwụ Kintampo. Onyeisi ndị uweojii na Kintampo bụ ACP Joseph Antwi Gyawu gwara ndị ntaakụkọ na ha amalitela inyocha etu ụgbọala abụọ ahụ si kụkọta isi ọnụ. O kwuru na ụgbọala nke nwere akara GT 5694 18 nakwa nke bu akara GT 3916 17 bu mmadụ ruru iri ise tupu ihe mberede n'ime ha. Etu ọ dị ugbua, eburula ndị dị ndụ merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ ka ha nata ọgwụgwọ. Akụkọ ọzọ pụtara n'ihe a na-ekwu na mgbe ha abụọ kụkọtara isi , otu n'ime ha nwuru ọkụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ nwụọ. Ndị uweojii na ndị na-emenyu ọkụ nọ ebe ahụ na-enyeaka ịchịkọpụta ngwongwo ndị mmadụ fọrọ ebe ahụ iji wee chọpụta nke bụ nke. Nigeria vs Seychelles Naịjirịa ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Seychelles mgbe ha zụkọtara onwe ha n'Asaba na mgbede. Gụọ ya n'uju ebe a Super Eagles abọriela Seychelles ka ọkụkọ Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49177627,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49177627,Kemi Badenoch: Nwafọ Naịjirịa abụrụla Minista na Britain,Nwafọ Naịjirịa bụ Olukemi Olufunto Badenoch abụrụla Minista na ahụ maka ọdịmma ụmụaka na mba UK.,"Olukemi Olufunto Badenoch Nna ya na nne ya mụrụ Kemi na Wimbledon, London, afọ iri atọ na itolu gara aga. 1. O toro na Lagos na mba US ebe o si gawa London mgbe ọ gbara afọ iri na isii. 2. Ọ gụrụ System Engineering na Mahadum Sussex, mechaa gụkwa akwụkwọ dịka ọkaiwu ma rụkwa ọrụ n'ụlọakụ n'ụlọọrụ kọmpụta na London. 3. Kemi bụbu onye omeiwu na London bụ nke ahọpụtara ya kemgbe 2007 ebe ọ nọchitere anya ndị Saffron Walden. 4. Ọ zọrọ ọchịchị ọkwa ịnọchite anya ọgbe ha n'afọ 2012 bụ mgbe ọ dara ntụliaka mana ọ mechara nwete ya bụ ọkwa mgbe ndị nọ na ya bụ oche rituru na 2015. 5. O meriri ntuliaka ịnọchite Saffron Walden na ụbọchị asatọ nke ọnwa Juna afọ 2017. 6. Ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ nọchitere ogbe ahụ. 7. Kemi so na ndị chọrọ ka Briten hapụ EU. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ" afirika-45109005,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109005,Saraki: Agbanyeghị ihe merenụ ike ọrụ agwụbeghị anyị,Bukola Saraki bu ụzọ chetara ndị mmadụ etu ndị ọrụ nchekwa a kporọ DSS kpuchiri ihu ha si gbochie ndị omeiwu na ndị ọrụ ha ịbanye n'ụlọomeiwu.,"Saraki chọrọ ka gọọmentị etiti nyochaa ma mara ndị aka ha dị na ya bụ nsogbu ikpe O kwuru na ihe a bụ ihe ihere nke na-ekwesịghị ime; ''Ihe a butere obodo anyị bụ Naịjirịa aha ọjọọ ma mịtara anyị mkpụrụ ọjọọ.'' Saraki kwuru na ya bụ omume gosiri adịghị ike ndị chọrọ isi azụ ụlọ chutuo ndị isi ulọomeiwu. Saraki na-arịọ ka gọọmenti kpachapụ anya maka ''gọọmentị dị n'ime gọọmentị'' ha Ọ dọkwara aka na ntị nye ndị na-achọ ihe n'ike n'ike sị na okwu a abụghị maka ya maọbụ osote ya bụ Ike Ekweremadu maọbụ Yakubu Dogara, kama ihe a metụtara ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjịrịa. Saraki kwuru na ọtụtụ olileanya dị n'ebe Naịjirịa nọ n'etiti obodo ndị ọzọ, ya mere ihe a ji jọgbuo onwe ya. N'ọnụ ya, ''Naịjirịa agafeela ụdịrị iberibe a na-ebute ndọghachi azụ.'' ""Chetanu na n'oge na-adịghị anya e kwuru m na Naịjirịa nwere ọchịchị n'ime ọchịchị a nọ ụgbua makana ọ gbawojuru anya ka onyeisi otu ngalaba ga-esi nye iwu ka a gaa wakpoo ụlọomeiwu. ""N'agbanyeghị ihe egwu dị na ya, anyị ga-aga n'ihu igbaso ikpe na-akwụghị ọtọ. Ndị Naịjirịa gosiri ụnyaahụ na ha agaghị ekwe mmegide oche maọlị. ""N'ihi na ọ bụ ndị Naịjirịa tinyere anyị n'ụlọomeiwu, mkparị ọbụla e nyere anyị bụkwa ndị Naịjirịa ka e nyere ya. ""Ihe mmụta m chọrọ ka gọọmentị etiti mụta ebe a bụ ka ha nye ndị ọrụ nchekwa ikike ịkwụrụ onwe ha."" Ihe niile o kwuru dị n'akara Twitter ya: Mana lee ihe ndị Naịjirịa na-asa onyeisi ụlọọmeiwu ukwu na Twitter: @Mansur_ahmed kwuru na mgbe izuụka a gachara, uche onye ọbụla ga-apụ n'ihe a mere n'ụlọomeiwu. Ebe @ola_subomi01 kwuru na ihe a ga-eji cheta Saraki ma ọ nwụọ abụghị ihe nwere isi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42869535,https://www.bbc.com/igbo/42869535,Raila Odinga echiela onwe ya onyeisi na Kenya,Onye isii ndị na nọghị nọchịchị na Kenya bụ Raila Odinga e were la aka ya duo onwe ya n'iyi ọrụ dika onye isii ala.,"Odinga akpọla onwe ya ""onye ọchịchị nke ndị mmadụ"" Ihe karịrị mmadụ narị atọ gbakọrọ na mbara etiti n'isiobodo bụ Nairobi ebe mmemme a mere. Ebe emechara nke a, ndị gọọmenti mba Kenya ekwụọla na otu ndị anoghị n'ọchịchị bụ NRM bụ otu ndị omekome. Ndị ọrụ na mba Kenya emechiela ụlọọrụ ndị mgbasa ozi iji gbochi nwepụta idu iyi ọrụ nke onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Odịnga. Ihe karịrị mmadụ narị atọ gbakọrọ na mbara etiti n'isiobodo bụ Nairobi ebe mmemme ndị anọghị n'ọchịchị ahụ kwesiri ị mee. Cheta na Odinga juru ịhe pụtara na ntụliaka nke onyeisi ala Kenya, yamere ejị kagbue ihe pụtara na ntụliaka nke ahụ emere n'Ọgọstụ. Uhuru Kenyatta meriri ntuliaka nke emegharịrị n'Ọkụtoba mana Maazị Ọdinga esonyehi na ya. Ndị mmadụ ọzọ na-ekwu na idu iyi ọrụ nke a Odinga mere bụ iji were mere onwe ya aha A gaara n'ịhụ chịe Kenyatta onye isi ala mba Kenya nke ụgboro abụọ na ọnwa Nọvemba. O nyekwara iwu sị ndị ụlọọrụ mgbasa ọzị ha egosina mmemme onye anọghị n'ọchịchị. N'itinye nke a, onye okaikpe kachasi na mba Kenya kwuru na onye na-egọsị mmemme ahụ ga-eme onwe ya onye ilo ala ha. Mana ụlọọrụ ndị mgbasa ozi ndị ukwu n'egosi mmemme ahụ n'elu igwe okwu Facebook na YouTube ha. Nke a bụ ịhe Ọdinga kwuru n'elu igwe okwu Twitter: Ọ gbanwela aha ya n'elu igwe okwu Twitter:" afirika-43102327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43102327,Massob ekwuola na ha achọghị uweojii nke steeti,"Otu na-agba mbọ maka iweta mba Biafra a na-akpọ Massob sị na ha ekweghị na mkpebi ndị kọmitee Pati na-achị, họpụtara maka ihe nyocha etu a ga-esi chịa Naịjirịa.","Ndị kọmitee ahụ sị na ikepụta uweojii nke steeti bụ ihe kwesịrị ka eme, mana Massob sị na ha achọghi ya, na ihe ha chọrọ bụ ka ekwea Naịjirịa ka ha wete Mba ha si na ha ga-akpọ Biafra na mba ise ndị ọzọ. Ndi Massob sị na etu esi egbu ndị mmadụ n'ebe dị icheiche na Naịjirịa gosiri na ịwepụta uweojii nke steetị bụ igbu oge. Onyeisi mgbasaozi na Massob bụ Sunday Okereafor kwuru nkea mgbe ya na ụlọ ntaakụkọ Punch nwere mkparịta ụka. Okereafor sị na Biafra dị njikere ikewapụ, ndị dịka Odua, Arewa na ndị ọzọ kwesiri ị na-akwado i nọrọ onwe ha. Ọ tụrụ aka na ogbugbu mmadụ dị icheiche na-eme na Naijirịa wee sị na ndị United Nations kwesịrị itinye aka hụ na ekepụtara mba isii site na Naịjirịa. ""Anyị sị mba maka uweojii steeti: anyị chọrọ Biafra maka ekwesịrị ikewa Naịjirịa ka enweta mba isii maka nchekwa Naịjirịa abụghị ihe uweojii steeti ga-arụ,"" Okereafor kwuru. Onye Massob a gara n'ihu sị na ọ tụrụ ya n'anya etu ndị Naịjirịa nọ na-ekwu okwu banyere mbinyeaka a ga-eme n'afọ 2019 ebe ndị ọchịehi nọ na-egbu ndị mmadụ n'obodo. Ọ dọkwara ndị na achị steeti dị icheiche n'ọwụwa anyanwụ aka na ntị sị ha ekwekwala ewepụta ala ebe ndị ọchịehi ga-anọ." afirika-46535911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46535911,Alex Otti: Aga m enyocha Ikpeazu na ndị otu ya,Gọọmentị Abịa steeti azachiela Alex Otti bụ onye ji ọkọrọtọ APGA azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na okwu ya na ya ga-enyocha nrụrụaka mere n'oge ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpezụ ma ya banye n'ọchịchị.,"Otti kwere ndị Abia nkwa na ngwa ngwa ya rigoro n'oche dịka gọvanọ na ya ga-enyocha ka gọọmenti Okezie ikpeazu nọ ugbua siri rụọ ọrụ. Otti onye kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị pati okwu na mmemme ọsọ nta vootu APGA mere n'ụmụahịa gwara ndị Abia ka ha tụnyere APGA akwụkwọ na ntụliaka na-abịa iji nweta ụdị ezi mgbanwe dị n'Anambara steeti ebe APGA nọ n'ọchịchị. Ihe ndị ọzọ Otti kwuru Alex Otti gara n'ihu kwuo na abịa bụ obodo kacha alaghachi azụ na mmepe obodo na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma kwee nkwa na ọchịchị ya ga eme Abịa steeti otu n'ime obodo eji ama atụ n'ụwa niile. O kwuru na isi okwu ndọrọndọrọ ọchịchị ya n'oge ugbua bụ""Ozuola bụ na Ozuola"" nke pụtara ""enough is enough"" n'olu bekee. ""Ozuola"" ahụ bụ nke ọkọwara dịka na ndaghachi azụ Abia state adịghị ya mma n'obi. Ihe Ikpeazu sara ya Mana na nzaghachi, Okezie Ikpeazu kwuru na egwu nyocha anaghị atụ ya, kama Otti buru ụzọ nyocha ije ya na ndị chịrịla steeti ahụ oge gara aga. Ikpeazụ onye kwuru nke site n'ọnụ Kọmishọna Mgbasaozi Abịa steeti bụ John Okiyi Kalu. Ọ sị : ""Egwu nyocha anaghị atụ anyị. Ọ bụrụ na ọ ga-enyocha, ya bido n'onwe ya, n'oge ya na ndị chịrịla steeti a tupu Ikpeazụ abata."" Ihere mere n'ọsọ achụnta vootu ahụ Ndị otu pati All Progressives Grand Alliance bụ APGA n'aha ịchafụ malitere ịchụ nta ndọrọndọrọ ọchịchị n'Abia steeti n'uju na mmemme ahụ. Ọtụtụ ndị ịsị pati APGA bịakwara n'ịsị obodo Abịa bụ Umuahịa iji gosi nkwado ha. APGA chịkọbara mmemme ọsọ nta vọọtụ na Catholic Field, Ubakala Road Umuahia ebe puku kwụrụ puku ndị pati ahụ zukọrọ iji gosi nkwado ha. Onye osote gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke kpọkuru ndị Abia ka ha tụnyere APGA akwụkwọ ka mmepe were bata na be ha. Nkem okeke ji Anambra maatụ, kwuo na ọ na ebu ụzọ n'ihe niile tata n'ihi na APGA nọ n'ịsị oche. ""Ikwado APGA bụ ịkwado mmepe obod"" Ọtụtụ ndị jị aha APGA azọ ọchịchị bụ ndị enyere ọkọlọtọ pati ahụ gosiri na ọ bụ ha ka patị nyere INEC aha ha." afirika-49460152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49460152,Man United vs Crystal Palace: A nyakasịala Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ,Ndị Manchester United etiela 'ebe ooo' dịka Crystal Palace tiri ha ịkpa n'isi n'asọmpi Premier League.,"Nke a malitere na nkeji 32 mgbe Jordan Ayew nwa Ghana nyeere ndị Crystal Palace goolu mbụ ha. Man. United shiri ajọọ ọnwụ inyete goolu mana Crystal Palace kpọrọ ekwe nkụ rue n'ebe ngwụcha asọmpia ahụ. N'ihi dịka nkeji 89 ka Man United nwetere goolu site n'aka Daniel James. E cherekwara na egwu agwụla mana Crystal Palace tiri wụrụ Man United n'ala site n'inye goolu ọzọ si n'aka Patrick Van Aanholt na nkeji 90. N'ikpeazụ Crystal Palace ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United n'ụlọ ha. Chelsea na Norwich City: Otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha ga e buru ọkpa ekele nye Chineke maka ime ka ha nwete mmeri mbụ n'asọmpi Premier League nke afọ 2019/2020. Chelsea nwetere mmeri a site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Norwich. Goolu malitere izo ka mmiri na nkeji 3, mgbe Tammy Abraham nyeere ndị Chelsea goolu ha. N'egbughi oge Norwich cheere Chelsea aka mgba site na goolu Todd Cantwell nyere na nkeji 6. Mason Mount nke Chelsea gwara Norwich na mmadụ na-akarị ibe ya mgbe o nyere goolu na nkeji 17. Norwich gwakwara Chelsea na ha adịghị achị site n'imezu goolu ha abụọ abụọ na nkeji 31 tupu e gbuchie opi n'ọkara nke mbụ. Dịka ọkara nke abụọ malitere, n'ime nkeji 68, Chelsea gosiri na ha nwere Abraham dịka nna mgbe Tammy Abraham nyere goolu nke abụọ ya n'asompi ahụ. Nke a mere Chelsea ji were ọkpụ goolu atọ Norwich satara abụọ gbapee igodo ji ọnụ ụzọ mmeri ha n'asọmpi Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44027505,https://www.bbc.com/igbo/44027505,Rochas ọ gara Daura ime gịnị ụnyaahụ?,Akụkọ na-ekwu na aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ji ọsọ gbagaa be onyeisiala Muhammadu Buhari na Daura dị na Katsin steeti ụbọchị ụka.,"E kwuru na ọ gara ịrịọ ka Buhari kagbuo nhọpụta nke otu pati ha bụ APC mere n'Imo steeti ụbọchị Satode maka na ya bụ Rochas achịtaghị aja na ya bụ nhọpụta. Rochas kwuru na ọgbakọ ndị APC na steeti ya nke a nọ na ya mee nhọpụta ahụ bụ ihe ọchị nke mere Buhari ga-eji kwụsị ya. Ka ya na onyeisiala mechara ọgbakọ ahụ na Daura, Okorocha kwuru na ya tụrụ anya ndọrọndọrọ onye kwuo uche ya n'ime pati ahụ maka na ya bụ ụzọ kacha mma. N'okwu ya; ""Ụdị ndọrọndọrọ ndị a na-atọ ọchị kwesiri ịkwụsị ebe ndị mmadụ na-achọ ibu igbe e ji eme mbinyeaka ma gbanwee mpụtara mbinyeaka ahụ bụ ihe agba ochie. ""Agwara m onyeisiala etu o si gaa ma kwee nkwa ịkwụsị ya."" Okorocha kwuru na onyeisiala kwuru okwu dịka onyeisiala na ya ga-agba mbọ hụ na ihe ndị ahụ bịara n'isi njedebe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51411610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51411610,Supreme Court Judgement: Ihedioha agaghachịla ịkpegharị ikpe oche ya na Hope Uzodinma,Emeka Ihedioha agaghachila n'ụlọikpe kachasị ịgwa ha ka ha lebaa anya ọzọ n'ikpe ha kpere nke chuturu ya dịka gọvanọ Imo State.,"Ihedioha na-ekwu na ọ bụ nghọgbu ka Hope Uzodimma ghọgburu ndị ""Supreme Court"" mere ha ji kwenye na ọ bụ ya meriri ntuliaka gọvanọ Imo steeti e mere na 2019. Igbo ga-adị n'Anambra steeti Gọọmentị Anambara steeti amachiela ịta ụmụakwụkwọ praịmarị nakwa sekọndịrị ahụhụ maọbụ iri ha iwu maka ịsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ha. Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche. Iwu a metụtara ụlọakwụkwọ pramarị nakwa ndị sekọndrị niile dị na steeti ahụ. Na mba ofesi, Onye dọkịta mbụ buru ụzọ gbaa ama maka ọrịa cọrọnavirus na mba Chaịna alaala mmụọ dịka o butekwara ya bụ ọrịa. Dọkịta a aha ya bụ Li Wenliang gbara ama ọrịa coronavirus n'ọnwa Disemba 2019 mana ndị uweojii mba ahụ sị ya mechie ọnụ na ọ maghị ihe ọ na-ekwu. N'egwuregwu, Otu egwu bọọlụ Real Madrid nakwa Barcelona akwarala laa n'asọmpi Copa Del Rey dịka e mriri ha abụọ n'abalị Tọzde. Real Sociedad ji ọkpụ goolu anọ asatara atọ merie Madrid ebe Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu gbalaa ndị Barca. Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" egwuregwu-45150731,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45150731,Premier League: Manchester United ji 2-1 merie Leicester City n'egwuregwu nke mbụ,"Iji bido afọ ọhụrụ Premier League nke 2018/2019, otu Manchester United gbara Leicester City 2-1 ka ha sukọrọ mpi.","Nwaafọ Igbo bụ Ndidi Wilfred na Paul Pogba na-azọ bọọlụ Na-erughị nkeji abụọ e ji bido egwuregwu bọọlụ a, Man Utd ji penariti nye goolu ka onye Leicester City bụ Daniel Amartey tinyere aka ya na bọọlụ Alexis Sanchez gbara. Paul Pogba gbakara neetị iji mee ka ọ bụrụ goolu mbụ a na-enye n'asọmpi Premier League nke afọ a. Ka ha gbara ihe ha gbara, Luke Shaw gbanyere goolu abụọ nke Man Utd na-enweta n'abalị ahụ. O nyere goolu a n'ime nkeji 82 nke ọkara nke abụọ. Ka o ruru nkeji 90 egwuregwu a kwesịrị ịgwụ, e tinyekwuru nkeji anọ, nke kpalitere mmụọ ndị Leicester City ma nye ha ohere inye otu goolu ha nyere. Jamie Vardy gbakara neetị na nkeji 90+2, ka o ji isi tiba bọọlụ biri n'igwe poostu dapụta. Onye nchịkọta otu Man Utd bụ Jose Mourinho nwere aṅụrị ka ha meriri egwuregwu nke mbụ ha na mbido afọ ọhụrụ a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50833179,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50833179,Benjamin Uwajumogu alaala mmụọ,All Progressive Congress akwala arịrị maka ọnwụ Sịnetọ Benjamin Uwajimogu bụ onye otu ha na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu.,"N'ozi ha depụtara n'akara twitter kwuru na Uwajumogu bụ onye umeala maara nke ekwe na-akụ na ndọrọdọrọ ọchịchị. End of Twitter post, 1 Sịnetọ Benjamin Uwajumogu anwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Wednezde 18 Disemba, afọ 2019. Onye bụbụ Kaụnselọ na-anọchiteanya Ideato North bụ George Ukeh gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Ukeh sị na o nwetere akụkọ ọnwụ ya n'ọgbakọ 'Whatsapp' nke ndị pati APC Imo steeti n'ụtụtụ taa. Onyeisioche pati APC n'Imo Steeti bụ Dan Nwafor sị na ọnwụ ya bụ ihe ijuanya nakwa oke ụsụ nye APC, Imo steeti nakwa Naịjirịa. Ruo oge ọnwụ ya, Uwajumogu bụ onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ndị ọrụ bekee, iwe ndị mmadụ n'ọrụ nakwa ịrụpụta ihe. Ihe e ji echeta ya bụ na ọ chepụtara iwu ga-ekpuchi ndị na-agba mpụ na nrụrụaka n'anwụ a kpọrọ 'Whistleblower and Witness Protection Bill'. Anyị ka na-agba mbọ ichọpụta ihe gburu ya bụ nke anyị ga-ewete n'uju. Ihe i kwesịrị ịma maka Benjamin Uwajumogu Akụkọ ndị ga-amasị gị: 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife" afirika-48665064,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48665064,Peter Obi: Enweghi ezigbote ọchịchị bụ ihe kachasị egbu Naịjirịa,Onye zoburu ọchịchị osote onyeisiala n'okpuru otu Peoples Democratic Party (PDP) bụ Peter Obi sị na Onyisial Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwesiri isoro usoro mba Saụt Afịrịka na India ọkachasị ebe ọmetụtara ịhọpụta ndị ga-eso ya rụọ ọrụ.,"Val Obienyem bụ onye mgbasa ozi Peter Obi gwara BBC Igbo na-ọbụ eziokwu na onye ndu ya kwuru okwu na mkparịta ụka ya na ndị ntaaakụkọ nwere na ngwụcha izuụka. N'okwu ya, Peter Obi sị na Naịjirịa ataala ahụhụ site na-enweghị ezigbote ọchịchị: ""Onye ọchịchi kwesiri ịma ebe ọ na-aga. mana, anyị nwere ọtụtụ ndị adịgboroja na-eme ka ha abụ ndị ndu."" Ọ gakwar n'ihu si na oke mbụte na-etinye Naịjirịa na nsogbu. ""Gwa m, ọ gịnị na-arụ ọrụ na Naịjirịa ugbua? Obodo ebe eji ijiri kwa ijiri."" Peter Obi gara n'ihu katọ onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu ojibeghi hoputa ndị ga-eso ya rụo ọrụ. Ozi onye mgasaozi ya sị na o ji Cyril Ramaphosa nke Saụt Afịrịka na Narendra Modi nke India maa atụ, ọkachasị etu ọ sị na ha mere ngwa ngwa wepụta ndị ha na ha ga-arụ ọrụ. Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari sị BBC Igbo na ya achọghị itinye ọnụ n'ihe Peter Obi kwuru ugbua. Cheta na Peter Obi na onye ya na ya so zọọ ọkwa na ntuliaka emere ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị 2019. Ha nọ n'ụlọikpe ugbua na-arịọ ka akagbuo mmeri Buhari meriri ha makana ha sị na ọbụghị n'ezie." afirika-44492963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44492963,Babachir Lawal: A chọrọ m ka EFCC nyocha ebubo eboro m,Onye bubụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ Babachir Lawal ekwuola na obi dị ya ụtọ na nyocha ndị EFCC na-eme n'ime ebubo eboro ya.,"E boro Babachir ebubo na O jiri nde narị naira abụọ ịsụọ ahịa O kwuru nke a n'ajụjụ ọnụ pụrụiche ndị ntaakụkọ gbara ya. N'okwu ya ""Ọ na-amasị m, n'ezie ọ dịla anya m chọrọ ka EFCC bata n'okwu a, maka ha nwere ndị tozuruoke nakwa ngwaọrụ dị mma iji chọpụta nke bụ eziokwu."" Cheta na onyeisiala Mohammadu Buhari chuturu Lawal n'ọnwa Ọktoba, 2017 maka ebubo mpụ na nrụrụaka ego. O kwuru na ebubo a agaghị emetụta mmekọrịta ya na onyeisiala, maka na a mabeghị ikpe. ""Ọ bụrụ na onyeisiala bụ nwanne m, ọ pụtara na ọ gaghị abụzị nwanne maka a na-eme m nyocha? Mmekọrịta na-agbasa n'ihi ebubo eboro onye aka ya dị ọcha."" EFCC si na ha ga-agbachi ebe obụla na-ehi ehi. Ndị kọmịttee lebara anya na nyocha Babachir Lawal gụnyere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, ọkaikpe gọọmentị etiti nakwa onye ndụmaọdụ nchekwa gọọmentị etiti. Ha zigara onyeisiala akụkwọ nchọpụta ha n'ọnwa Ọgọsụtụ afọ 2017 ebe achụrụ ya na ọnwa Ọktoba afọ 2017. A chụrụ ya maka ebubo inye ọrụ ngo n'ụzọ na-ezighi ezi nke ego ya karịrị nde narị naịra abụọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44187679,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44187679,Gọọmentị etiti chọrọ igbu m - Wike,Aka na-achị Rivers steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmentị etiti na-akwado igbu ya.,Otebeghị aka ụlọikpe machiri EFCC na DSS ịchọ ihe n'ụlọ Wike O kwuru na ha chọrọ igbu ya n'etiti igwe mmadụ ma bo ya n'amaghị ụma. Wike kwuru nke a ụnyahụ ebe ọ gara ụlọụka dị na Port Harcourt. O jikwa ohere ahụ kọwara ndị mmadụ etu otu ndọrọndọrọ ọchịchị gọọmentị etiti bụ APC sị eyi ya egwu. Wike kwuru na ọ ga-eme ihe niile iji we hụ ọchịchị onye kwuo uche ya kwụ chịm na Rivers steeti. O kwuru na atụmatụ ha agaghị abịa na mmezu makana Chukwu nonyere ya tinyere na-enwere izu ọjọ dị ukwuu maka Rivers steeti. Mana gọmentị etiti agọnaghụ na ya bụ ebubo. Onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa bụ Shehu Garuba zaghachiri si ndị mmadụ leghara anya ebubo aṅụrụma codeine na-ebute na-ekwesighị nzaghachi. Shehu kwuru ka ndị mmadụ kwụsị iji atụmatụ ha kpe gọọmentị etiti ikpe. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-56583108,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56583108,"Herdsmen Attacks in Ebonyi, Enugu states: Ipob sị na ndịagha Naijiria na-ekpuchi ndị Fulani ochiehi - Ipob",Otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenuous People of Biafra' eboola ndịagha Naijiria ebubo iji nkata ekpuchi ihe ndị ọchịehi na-eme dịka ha na-egbusi ndị mmadụ aghara agharana Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndida Ndịda.,"Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ N'ozi nke odeakwụkwọ otu ahụ bụ Emma Powerful zigara ndị ntaakụkọ ụbọchị Tọzde, Ipob kwuru na ogbugbu ndị ọchịehi gburu ndị Biafra enweghị ihe ha mere n'Enugu na Ebonyi steeti gosiri ewu na ọkụkọ na ndị agha Naijiria na-adọnyere ha ukwu. Ipob gara n'ihu n'ozi ahụ sị, ""Ọnyụpa ndị ọrụ nchekwa Naijria gbara n'ịchụ ma nwuchie ndị kpara mkpamkpa ahụ bụ ihe gosiri n'ezie ihe anyị na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa bụ ha na-ekpuchi ndị oyindu egwu na-akpagharị n.Ndida Naijiria ka ha abụ ndị Fulani Ọchịehi."" Ha jụrụ n'ajụjụ sị, ""Kedụ ebe ụgbọelu helekọpta ndị agha n'efegharị n'Ọlụ n'ọnwa Febụwarị na-achọ ndị ESN nọ? Kedụ ebe ndịagha gburu ndị Biafra enweghị ngwaọgụ ha ji na-eme mgbatị ahụ n'Emene nọ?operatives in February? Kedụ ebe ndị uweojii nzuzo DSS na-achụgharị ndị Ipob na ndịị na-agba mbọ maka nwereonwe Biafra nọ?"" Cheta na ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'Enugwu nakwa Ebonyi na nsonso a. Hibenu ndị ọrụ nchekwa nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ - Ohaneze Ndigbo George Obiozor gwara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha mee ngwangwa hibe otu nchekwa nke ha. Otu Ohaneze ndị Igbo akatọọla mwakpo nke ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Mọnde, abalị iri atọ nke ọnwa Maachị afọ 2021. Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ George Obiozor wepụtara akwụkwọ ozi iji katọọ ya bụ ihe ma kpọọ oku ka ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ hibe otu nchekwa nke ha. O kwuru sị: ""Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na gọọmentị etiti achọghị ige ntị n'ihe Ohaneze Ndigbo na-ekwu gbasara ihazigharị ọchịchị Naịjirịa ka mpaghara ọbụla nwee ike ichekwa onwe ha etu o kwesịrị ekwesị."" ""N'ihi nke a, anyị bụ ndị Ohaneze Ndigbo n'ụwa niile na-agwa ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha mee ngwangwa hibe otu nchekwa nke ha."" CAN katọkwara mwakpo a Goddy Okafor bụ onyeisi otu CAN na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Otu jikọrọ ndị okpukpere Christ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ 'Christian Association of Nigeria' katọkwara mwakpo a emere n'Ebonyi Steeti. Onyeisi ndị CAN na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Goddy Okafor kwuru na ya bụ ihe na-awụ akpata oyi ma bụrụkwa nnukwu ihe ọjọọ. Goddy Okafor gwara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha kulie n'ụra ma rụọ ọrụ ha iji gbochie ụdị ihe a n'ọdịnihu. Anyị achọtala ndị gburu mmadụ 15 n'Ebonyi steeti, ha ga-ata ahụhụ dị na ya - David Umahi Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Gọvanọ David Umahi agaala mgbaru ebe ndị a na-eche bụ ndị ọchịehi wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti. Umahi bụ onye ya na Kọmishọna uweojii nke steeti ahụ na ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị so gaa ya bụ mgbaru, kwuru na ọ bụ mmadụ 15 ka e gburu na ya bụ mwakpo mere n'obodo Nkalaha, Obegu, Umuhuali na Amaezu dị n'Okpuru Ọchịchị Ishielu dị na steeti ahụ. Umahi kwukwara na ha amatala ndị kpara mkpamkpa a na ndị dunyere ha, ma kwuo na iwu megidere na ha ga-ata ahụhụ dị na ya. O kwuru ka ọ na-agwa ndị obodo ndị a ihe metụtara okwu, dịka ọ na-arịọkwa ha ka ha ghara iji iwe jiri aka ha mee ihe iwu akwadoghi. Umahi kwukwara na ọ dị mwute na ụdịrị ihe a na-eme n'Ebonyi, ma kwuo na ọ tụrụ ya n'anya na ndị na-achị ehi n'okpuru ọchịchị Ishielu si ebe ahụ kwapụ ọsịsọ, nke pụtara na ha ma ihe gbasara ogbugbu ndị obodo ahụ, ""ha kwapụrụ n'agbanyeghi mbọ niile gọọmentị m, gọọmentị mpaghara Ọwụwa-Anyanwu na ndị ọrụ nchekwa na-agba ịhụ na e nyere ha ezi nchekwa na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ niile."" ""Ọ dị mma na anyị achọtala ndị dunyere ndị bịara ebe a kpaa mkpamkpa a. Agaghị m ekwuputa ya, mana aga m ewega aha ndị mere ihe a n'aka ndị isi ma chebiri ihe ha ga-eme. Mana anyị na-akatọ mwakpo a, ọ bụghị naanị n'Ebonyi ka ọ na-eme, mana ọ bụrụ na a hapụ ya ka o mere gaa n'ihu, o nwereike ibute agha imeụlọ na Naịjiria"". Cheta na Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti kwuru ụnyaahụ na ọ bụ mmadụ isii ka ha ka hụrụ nwụrụ. Odah kwukwara ụnyaahụ na ha ka na-eche ka ndị uweojii ezigara ebe ahụ bịa kpesa ihe ha hụrụ, tupu ha ekwuo ihe mere n'uju. Mkpamkpa a tara isi ndị mmadụ butekwara mmebi ọtụtụ ngwongwo ndị mmadụ, dịka a gbara ọtụtụ ụlọ, ụgbọala na ọgbatumtum ọkụ. Otu onye hụrụ mgbe ihe mere ma na-achọghị ka a kpọọ ya aha, kwuru na ndị a a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo obodo ha ma jiri mma wakasịa ndị mmadụ ahụ. O kwukwara na ha gburu otu ụkọchukwu nke ụlọụka Metọdist, ma burukwa ụfọdụ ngwongwo ndị mmadụ gbafuo. Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ishielu bụ Sunday Eze na Kọmishọna na-ahụ maka mmelite achụmntaego bụ Dkta. Stephen Odo bụ onye obodo ahụ, du ndị ọrụ nchekwa gaa iji anya ha hụ ihe mere. Ha kwara arịrị maka mkpamkpa ndị a a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi na-akpa, ma tie ezinaụlọ ndị ihe metụtara aka n'obi. Gọọmentị kwere nkwa na ha ga-enyocha ya bụ mkpamkpa ma nwụchie ndị ọbụla aka ha dị na ya." afirika-50450803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50450803,Lion House: 'E si na mba Kamerun wee zubata ọdụm a hụrụ n'ụlọ anyị'- Onye nche,Akụkọ na-eru anyị nti gbasara ọdụm achọpụtara n'ụlọ nwoke bị na Victoria Island dị na Lagos anọrọla bụ na ụlọ anụmanụ dị na Lekki.,"Onyeisi ngalaba Task Force akpọrọ 'Lagos State Environmental Sanitation & Special Offences (Enforcement Unit) LASESSO.' bụ Yinka Egbeyemi kwuru na onye nche ụlọ ebe ahụrụ ya bụ anụmanụ na-anọ kwuru na e si mba Kamerun wee zubata ọdụm ahụ. O kwukwara na anwụchiela onye nche ụlọ ahụ. Etu o si kwụrụ ugbua ọ sị na ha na-eche ka were nwoke India ahụ kpọnye ndị uweojii Lagọs steeti. Nke a ọ bụ ọdụm na-eche mba? Kedu iwu agwa a nwoke a kpara megidere? Okaiwu Goddy Uwazurike kwuru na nwoke dara iwu ndị a Ndị ọrụ Lagos steeti akpọrọ ""Lagos Task Force Team"" awụchiela n'ogbe 229 Muri Okunola Street, Victoria Island ịgba ọdụm na-eche be otu nwoke India ọgwụ. Akụkọ pụtara na ndị bi n'ogbe na-eti mkpu maka etu nwoke India si were ọdụm na-eche be ya. Lee ụfọdụ foto ndị ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ setere. Ụfọdụ ndị bi n'agbataobi pụtara na-ekiri ka a ga-esi gba ọdụm ahụ ọgwụ ụra. Ndị ọrụ gọọmenti Lagos steeti gakwara n'ihu mado akwụkwọ gosiri na nwoke ahụ ji ọdụm eche ụlọ ya dara iwu obodo. Lekwa ihe ndị ọzọ mere n'onyonyo anyị ka na-abịa nakwa akụkọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51159848,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51159848,Buckingham Palace: Harry na Meghan agaghị azazị Aha Eze ha,Nwaeze Harry na nwunye ya ekwuola na ha ga-akwụghachị nde pawund abụọ na ọma ejiri ruzie ụlo obibi 'Frogmore Cottage' nke dị n'akaobi Eze ndị UK.,"Dị na nwunye a agaghịzị anọchite anya Eze nwaanyị ebe ọbụla. Ọ bụ na oge udu mmiri ndị mba Briten ka iwu a ga-ebido ọrụ. Lee ozi sị n'aka Eze Nwaanyị N'Anambra steeti Ndị uweojii na-ekwu na ha agaghị anabata ọgbaaghara n'Anambra Steeti. Ndị uweojii nke Anambra steeti esitela n'ọnụ onye na -ekwuchitere ha bụ Orlando Ikeokwu were dọọ ndị steeti ahu aka na nti were si na ọnye ọbụla chọro ime nkagharị iwe mee ya dịka iwu Naijirịa si kado. Ndị uweojii sị na na-ama ọkwa a maka akụkọ na enwere ndị chọrọ ime ngagharị iwe maka ikpe ekpere nke mere Hope Uzodinma Gọvanọ Imo steeti . Ada 'El Chapo' ebidola ire mmanya ọkụ n'aha nna ya. Nwada bụ Alejandrina Guzman ebidola iji aha papa ya ere mmanya ọkụ na mba MExico nke ọ kpọrọ 'EWl Chapo'. N'otu aka ahụ ka ha nwere ụlo ọrụ na-arụpụta akwa oyiy nke ha kporo 'El Chapo 701'. Ha nwetere aha a dịka ndị 'Forbes' kpọrọ Joaquin 'El Chapo' Guzman onye nke nari asaa na otu kacha nwee ego n'ụwa niile. Alejandrina na akọwa na ọ bụ osikapa, mmanu aṅụ na 'Malt' ka ha ji mee ya bụ mmanya. Dịka osirị kwuo, ""Ọ dị nọọ mma"". El Chapo bụ onye na-ere ọgwụ ike ama ama na-ezu ike na mkpọro ụgbụa dịka ndị mba Amerịka tụrụ ya nga maka mgbere ọgwụ ike. Otu nwaanyị ekwuola na jigida ya zọpụtara ya n'aka ndị chọrọ iji ike wakpo ya na mba Lebanon. Gloria Tayelolu Bright kọwara na ọ bụ aghụghọ ịnye ya ọrụ onye nkuzi Bekee ka eji rapụta ya na mba Lebanon ebe o bidoro ị ta ahụhụ. Ọ kwuru na onyeisi ya n'ọrụ bidoro ịnye ya nsogbu mmekọ ahụ mgbe niile mana ọ kwụsịrị mgbe ọ gwara ya maka jigida ya. N'ọnụ ya ""a gwara m ya na nwoke ọbụla dinara m karịa onye nyere m jigida a ga-agbapụ ara ma nwụọ n'abalị asaa, ya mere o ji hapụ m aka"" Gloria ji ụmụaka abụọ so na ndị atọghapụrụ na mmegbu na Lebanon. Gọọmentị na-akụrị ulọ n'Ọchanja Gọọmentị Anambra steeti amalitela ịkụtu ụlọ ndị gbara ọkụ n'ahịa ọchanja dị n'ọnịcha. Dịka ụlọntaakụkọ ABS siri kwuo, ụfọdụ ụlọ ndị dị ebe ahụ na-amazi jijiji nke nwereike ịdagbu mmadụ maọbụrụ na amaghị ihe e mere ya. N'ofesi Nwoke kachasị dị mkpụmkpụ na ndị ji ụkwụ aga ije n'ụwa niile anwụọla dịka ọ gbara afọ iri abụọ na asatọ. Khagendra Thapa Magar nwụrụ n'ụlọọgwụ dịka ọ rịachara ọrịa mkpụrụ obi. N'egwuregwu, Ọgbaa bọọlụ Naịjirịa bụ John Ogu ekwuputala obi ụtọ ya n'ịlaghachi agba bọọlụ dịka ọnwa isii gachara. Ogu gbaara otu ọhụrụ ya bụ Aladalah asọmpị mbụ n'ụbọchị Fraide. Uzodinma achụọla ndị niile Ihedioha were n'ọrụ okpuruọchịchị n'Imo steeti Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma achụọla ndị niile onye ọnọchiri bụ Emeka Ihedioha were n'ọrụ ilikọta okpuru ọchịchị ime obodo nke steeti ahụ. Ihedioha chụrụ aka na-achị ukpuru ọchịchị iri abụọ na asaa dị n'Imo steeti ka ọ rigoro ọkwa gọvanọ n'ọnwa Mee nke 2019. Ndị a Ihedioha chụru bu ndi meriri ntuliaka gọọmentị Okorocha mere iji họputa aka ga-achị okpuru ọchịchi ime obodo ndi n'afọ 2018. N'Imo kwa, kepu kepu na-eru anyi ntị bụ na-amalitela inyeghachị ndị mmadụ ụgbọala na akụnaụba ndị ọzọ gọọmentị Ihedioha nara ha. Gọọmentị Ihedioha nakọrọ akụnaụba ndị a site na ngalaba o hibere maka nke a. Na Chaịna, Enwere nje isi akpọrọ coronaviruses ama na-efesa mmadụ tupu ahụ nke ọhụrụ A na-enyochazị ndi ji ụgbọelu eme njem na mpaghara Chaịna maka nje ọhụrụ gburu mmadu abụọ kemgbe ọpụtara mbụ n'obodo Wuhan n'ọnwa Decemba 2019. Ndị ọkachamara n'ihe banyere ọrịa sị na agbanyeghị na ọ bụ mmadụ iri anọ na ise ka eji igwe eji enyochapụta ọrịa ahụ n'ahụ ndị ọ fesagoro ga-eru puku n'ọma. Mbughari Iko Mba Afirịka etinyela Jurgen Klopp na gbagharịa Onye ndụ Liverpool bu Jugen Klopp na-akwa akwa arịrị maka etu e si buga iko mba Afirịka gawa ọnwa Janụwarị. Ọ sị na nke ga-eme ka ha gbara aka Sadio Mane, Mohamed Salah na ndi ọzọ gawa ịsọmpị n'oge dị ha ezigbote mkpa. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla" afirika-52766509,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52766509,Nwaanyị Ngbo ndị Agila gburu gafere ebe gọọmentị sị onye agala - Ndị uweojii Ebonyi steeti,"Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụ nnupuisi iwu gọọmentị tinyere, butere ọnwụ otu nwaanyị na nwa ya n'obodo Umugudu-Akpu dị na Ngbo na steeti ahụ.","E ji ihe gbochie okporoụzọ n'obodo Izzi dị n'Ebonyi dịka ha na ndị Ukelle na-azọ ala. Ọzụzọ okeala ebutela ọnwụ ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nwaanyị ahụ na nwa ya so gaa n'ọrụ ugbo ha dị nso okeala ndị Ngbo na ndị Agịla dị na Benue steeti, bụ ebe gọomentị Ebonyi steeti kwuru sị ndị mmadụ agazịla iji gbaara ụdịrị okwu na ụka a ọsọ. Odah kwuru na esemokwu a tara isi mmadụ abụọ a, mere n'ụbọchị 20 nke ọnwa Mee 2020. O kwuru na ha bụ ndị uweojii anwụchiela Igwe nakwa onyeisi otu obodo Umugudu-Akpu, n'ihi na ha gharịpụrụ n'ihe ha kwesịrị ime, nke bụ ịhụ na ndị ha na-achịkọta gere ntị ma ghara itinye onwe ha na ụdịrị nsogbu a. Odah kwukwara na ihe mere e ji sị ndị obodo abụọ a agala nso okeala ahụ bụ n'ihi na e ji ya mere ihe akaebe nke Bekee kpọrọ ""exhibit"", na nnyocha ndị uweojii na-eme. Marakwa na nke a abụghị nke mbụ, nke abụọ maọbụ atọ okwu ala na okeala na-ebute nkwafu ọbara n'Ebonyi steeti. Ọnwụ nke ọnwa Mee a na-abịa na-erughi ọnwa atọ ụdịrị okwu a tara isi ihe ruru mmadụ iri n'obodo Ndiagu Orie, dị n'Umugudu-Akpu. N'ọnwa Mee nke afọ 2019, mmadụ anọ nwụkwara n'ụdịrị okwu a. Ha bụ ndị nọ na kọmitii e kewapụtara ka ha mara etu a ga-esi kwụsị esemokwu a dị n'etiti steeti abụọ a. Ihe nkiri a na-akọwa maka esemokwu dị n'etiti ndị Izzi na ndị Ukelle: Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ" afirika-53781888,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53781888,Akanu Ibiam Airport : Gọọmentị akụtuola ụlọ nwoke kwaturu ngwuru aja ọdọụgboelu n'Enugwu,"Gọọmenti Enugwu steeti akụtuola ụlọ Arc. John Emejulu dị n' Eziokwe Street, Community Estate, dị na Trans-Ekulu, Enugwu site n'ụlọrụ ha a kpọrọ 'Enugu Capital Territory Development Authority', ECTDA.","Ndị ọrụ gọọmenti ji ụtụtụ gaa kwatuo ụlọ Emejulu maka ebubo na ọ kwaturu ngwuru ọdọụgbọelu Enugwu Nke a na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Mazi Hadi Sirika machara ọkwa na ha ga-akpụpụ Emejulu ụlọikpe maka ịkwatu aja ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Sirika kwuru ụbọchị Tọzde na ọ bụ ihe ọjọọ na otu onye ga-akwatu ihe gọọmentị na-arụ ga-abara Naijiria niile uru. Nke a mere ka Sirika gwa gọọmenti Enugwu ka ha gbaa mbọ ka aka kpara ya bụ nwa amadị. Mana onyeisi ngalaba ECTDA bụ Josef Onoh onye nọ mgbe a na-ekutu ụlọ Emewjulu kwuru na ọ bụghị maka ọkwa Minista Sirika mara mere ha jiri kụtuo ụlọ ya. Onoh kwuru sị ""E nweghị ihe gbasara anyị na ikike ụlọikpe nyere nwoke a"". Ọ kọwara na ọ bụghị nanị ụlọ Emejulu ka ha kuturu, na ha kuturu ụlọ ndị a maka na ha nọchịri ụzọ ebe mmiri sị aga. Ebe a bụ ala apịtị na mmiri ndị mmadụ were aja wuchie ma rụo ụlọ n'elu ya. Onoh mere ka BBCIgbo mara na ihe dịka ụlọ isii nọ ebe ahụ adawala n'ihi na ala ahụ esighị ike. O kwuru sị ""ọ bụ kamgbe afọ 2018 ka ewepụtara ụlọ ndị a maka ikutu, ebidola ikpe a tupu m bụrụ onyeisi ụlọọrụ ECTDA"". O kwukwara na enweghị ihe jịkọrọ Enugwu steeti na ala ọdọụgbọelu Akanu Ibiam. Onoh kwuru na ikpe Emejulu nwere bụ ya na gọọmentị etiti nwere ya. Onoh kwuru na ọ bụ ihe ndaba mere o ji dịka gọọmentị a na-abọkwara maka ihe Emjulu mere. Lee ya n'ihe nkiri ka o si mee ebe a: Nchọpụta BBC mere gosiri na ya bụ nwoke bụ John .J. Emejulu bụ onye nyochara nnukwu ala ahụ gọọmenti weghara ma nwekwaa ọtụtụ ala ebe ahụ. Na afọ 2016, ka gọọmenti Enugwu kwaturu ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ rụrụ ebe ahụ ma weghara ya bụ obosara ala dịka ebe ha ga eji mee Free trade Zone. Emejulu na ndị obodo Nike nakwa ndị nwere ala na ụlọ ebe ahụ kpụpụrụ gọọmenti Enugwu n'Ụlọ Ikpe n'ihi na anaghara ha ala ha ma kwatuo ụlọ ha n'ike na-akwụghachịghị ha ụgwọ ọbụla. Mazi Emejulu kpọrọ ndị ọrụ were iwe ga ụbọchị wenezde August 12 ga kwatuo ya bụ fenci ejiri gbachie ala ahụ. Dịka Sirika siri kwuo, gọọmenti ewegharala ala ndị ahụ ma na achọkwa JJ Emejulu ka ọzara ọnụ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49104004,https://www.bbc.com/igbo/49104004,EFCC: Enweghị ọgbaahara mgbe anyị gbachiri 'Rochas Okorocha Foundation College',"Aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha akpọọla Effcc oku ka ha mee i =he ọbụla ha chọọ ime, hapụ imetọ ya aha ya site na ụdị ozi ha na-agbasa.","'Onweghị onye anyi na ya nwere Ogbaahara' EFCC Okorocha kwuru nke a dịka akụkọ na-ewu na EFCC agbachiri ụfọdụ ụlọakwụkwọ na ụlọ nke Rochas Okorocha, ndị ezinụlọ ya na nke ndi ụfọdụ ha na ya nwere mmekọ. Ndị a gbachiri ụlọ ha bụ Uloma Okorocha-Nwosu, Paschal Obi na ogbe ụlọ(estate) nke a rurụ n'aha nwunye Rochas Okorocha bụ Nkechi Okorocha. Otu onye na-arụru Sịnetọ Okorocha ọrụ achọghị ka ekwuo kwere na ọ mere n'ezie. Kama ọ gwara BBC Igbo na ""o zighi ezi ka ndị EFCC gbachie ụlọakwụkwọ e hibere kemgbe afọ iri na abụọ tupu Rochas Okorocha abata n'ọchịchị"". Ọ rutukwara aka kwuo sị na "" ihe a mere aghaghị ibụ aka ọrụ ndị iro."" Ọ kwukwara na umuakwụkwọ ha na-agụ akwụkwọ mgbe ndị EFCC biara chụpụ ha ma gbachie ụlọakwụkwọ ha. Onyeọrụ EFCC na achọghị ka a kpọọ aha ya kwụrụ na o nweghị onye ha na ya lụrụ ọgụ ma ọ bụ nwee ọgbaghara ọbụla mgbe ha gara igbachị 'Rochas Okorocha Foundation College'. Onyeọrụ EFCC a na akọwa na nke a bụ usoro ha jị arụ ọru ma ọ bụrụ na onye ha kporo oku ka ọ bịa zara isionwe ya maka nyocha maka mpụ gbasara ego abịaghị. EFCC gwara BBC na ụmụakwụkwọ nọ ezumike ma kwuo kwa na ha nwere iheama nke onynyo ha ga eji were gosi na onweghi onye ha na ya lụrụ ọgụ . Lee akwụkwọ ọzi ndị EFCC deputara na Twitter na akọwa ihe mere. Ọnụ na-ekwuchitere ulọakwụkwọ a kwuru na umuaka n'agụ akwụkwọ mgbe EFCC kpọchiri ụlọ akwụkwọ ha BBC na eche ihe onyonyo igbaama ndị 'Rochas Okorocha Foundation College' kwuru na ha ga ezite. Lee Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri a Johanesburg: ""A chụrụm n'ọrụ mana a bụzịm onye na-enye ọrụ na South Africa""" afirika-50835635,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835635,Donald Trump: Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara,"Dịka ndị Ụlọomeiwu obele na mba Amerịka ebinyere aka n'akwụkwọ akpọrọ ""Articles of Impeachment"" na Bekee Onyeisiala Donald Trump si na onweghi ebe ya na-aga.","Atụmatụ 'impeachment' a kwuru na Trump emetere ihe ekwesiri iji chụọ ha dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. Mana, dịka o dere n'akara Twitter ya, Trump sị na ihe a ndị Ụlọomeiwu Nta mere ezighi ezi ma kwuo na ha ya ka kwụ chịm na-eche ikpe n'Ụlọomeiwu Ukwu. End of Twitter post, 1 Ọ bụ Nancy Pelosi bụ Onyeisi Ụlọomeiwu nta gụpụtara atụmatụ ""Article of Impeachment"" a ọ sị bụ maka Trump iji ọkwa chọọ ọganyị ihu nke a etu ekwesighi ekweshi. Pelosi bụ onye kachasị nwee ọkwa n'ogige pati Democrat bụ ndị tinyere uchu n'atụmatụ a. Nancy Pelosi ka ọkụrụ kpọmiji maa Trump ikpe mpụ Pelosi kwuru sị ""ọ bụ agwa na ezighị ezi onyeisiala kpara mere ka o dị mkpa na achụturu ya n'ọkwa"". Ka emechara ntuliaka eji maa Trump ikpe, Pelosi dere n'aka Twitter ya na onweghi onye gafere ikpe ikpe. Dịka ọ dị ugbua, Trump ka bụkwa onyeisiala Amerịka. Ọ bụ ndị ụloomeiwu ukwu ka ekpe zị ikpe ya ụgbụa. Kedu ihe ndi na-akwado Trump na-ekwu Patị Trump kwụ ya chịm n'azụ. Nke pụtara na enweghị olileanya na ha ga-ama ya ikpe na Sineti oge akwụkwọ 'impeachment' a rutere ebe ahụ. Ọtụtụ ndị Omeiwu patị Republikan tinyekwara ọnụ ma katọọ atụmatụ ịma Trump ikpe. Gịni butere okwu ịchụpu Donald Trump Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Onyeisiala Trump gwara onyeisiala mba Ukrane bụ Volodymyr Zelensky ka o nyochaa onye bụbụ osote onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden. Dịka Trump siri kwuo, Biden na nwa ya nwoke aha ya bụ Hunter Biden tinyere aka na nrụrụaka banyere ego mgbe nwa amadị ahu na-arụrụ otu ụlọọrụ na Ukarane ọrụ. Nke bụ eziokwu bụ na ndị Ukrane mere nyocha maka ebubo a ma sị na onweghi mpụ ha hụrụ. Nke bụ isi mmiri bụ na iwu Amerịka machiri onyeisiala mba ahụ ị sị ka mba ọzọ mere ya ihe ọma. Lee Usoro njem ichutu Donald Trump Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52298358,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52298358,Anambra State: Ogbugbu otu nwaokorobịa na Nkpor ebutela ngagharịiwe,Akụkọ na-ewu na soshal midia na mgbede Wenezde bụ na ndị uweojii Anambara steeti gburu otu nwaokorobịa na Nkpor.,"Ya bụ ihe mere na mpaghara ahịa 'New Tyre' ebutela ngagharịiwe dịka ndị ntorobịa na-egosipụta mwute ha. Ọtụtụ ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na Twitter, Facebook nakwa Instagram gosiri ebe ozu ya bụ nwata nwoke tọgbọ n'ala ndị mmadụ gbaa okirikiri na-aba mba n'iwe. Mana Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara azaghị oku ekwentị BBC Igbo kpọrọ ya ugboro ugboro iji mata ihe merenụ. End of Twitter post, 1 O dochabeghị anya etu ya bụ ihe si mee mana BBC Igbo ka na-esi imi n'ala ịweta ya bụ akụkọ n'uju. Cheta na gọọmentị Anambara steeti mechiri mkpagharị ndị mmadụ iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus. Mana akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ụmụokorobịa na-agba bọọlụ ka ya bụ njinji nọrọ jie. Ndị ọzọ kọkwara na ndị ntorobịa ji 'acid' wee chụọ ndị uweojii ahụ e boro ebubo igbu mmadụ ọsọ. BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ Haruna Mohammed maọbụ onyeisi ndị uweojii n'Anambra. N'aka nke ya, onyeisi ngalaba mkpesa nke ndị uweojii Naịjirịa aha ya bụ Markus Ishaku Basiran, kwuru na ha amalitela ileba ya bụ okwu anya. Basiran depụtara nke a n'akara Twitter ya ma kwuo na Kọmishọna ndị uweojii nke Anambra steeti abanyela na ya bụ okwu Mana Kọmishọna mgbasa ozi na Anambra bụ Don Adinuba kwuru na ya hụkwara ya bụ akụkọ na soshal midia, mana ndị uweojii agwabeghi gọọmentị maka ya. Adinuba kwuru na ""ọ bụ mgbe ndị uweojii gwara anyị maka ya ka m ga-ama ihe m ga-ekwu"". Onye ọrụ nchekwa agbagbuola mmadụ n'Aba N'akụkọ dịka ibe ya, gọọmentị Abia steeti agbarụọla ihu maka ọnwụ otu nwaokorobịa a na-ekwu na ọ bụ otu onye ọrụ nchekwa ji egbe gbagbuo ya n'Aba. John Okiyi bụ kọmishọna mgbasa ozi n'Abia steeti kwupụtara nke a n-ehihie Wenezde. Okiyi kwuru na ya bụ ihe mere n'Ụmụịkaa 'junction' nke dị n'okpuru ọchịchị Isialangwa South. Ọ gara n'ihu kwuo na Gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela ntuziaka ka Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ tinye anya na mmiri ma nwụchie omye kpara arụ ma kpee ya ikpe. Dịka Okiyi si kwuo, nke a abụghị nke mbụ ndị ọrụ nchekwa na-egbu mmadụ n'Abịa steeti. Ihe mere gọọmentị Uzodinma ji enyocha Ihedioha Emeka Ihedioha Gọọmentị Imo steeti enyela ikike ka-ebido ime nyocha maka ihe karịrị ijeri naịra 19 bụ ego ndị okpuru ọchịchi ime obodo e kwuru na ọ na-efu efu site n'oge Emeka Ihedioha nọ n'ọchịchị. Ha kwuru na ọ bụ n'ọba ego nke ndị okpuruọchichị n'Imo steeti nakwa nke ngalaba na-ahụ maka ndị eze ka e si sepụ ya bu ego n'ime ọnwa asaa Ihedioha chịrị. Dịka Kọmishọna mgbasa ozi bụ Declan Emelumda si kwuo, etu e si zupu ya bụ ego bụ site na iru ọrụ adigboroja di icheiche ebe ndị ọ bụ ọrụ a na-ahụghị anya. Emelumda kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'Owerre n'ụbọchị Tuzde. O gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ha na-eme nnyocha nke afọ gara aga dịka ọ dị na usoro gọọmentị ka ha chopụtara ya bụ nrụrụaka. O kwukwara na nnyọcha maka ebubo a dị n'atụmatu gọọmentị Imo steeti wepụtara iji hụ na ndị ọrụ gọọmentị rụrụ ọrụ ha dịka o si kwesi, nakwa ịhụ na-erubere iwu obodo isi gbasara mmefu egọ ọha nke dị n'aka gọọmentị. BBC Igbo kpọtụụrụ Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka mgbasa ozi Ihedioha mana o kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi ebe ha ga-asa ebubo niile ahụ. Mana ụlọọrụ 'Wallhouse W.A Ltd' wepụtara akwụkwọ ozi ebe ha kwuru na ebubo gọọmentị Ihedioha boro ha bụ ụgha. 'Wallhouse' kwuru na ọ bụ ha ka gọọmentị Ihedioha nyere ọrụ ibute ụgbọọala 'Caterpillar' na nnukwu ụgbọala ndị ọzọ e ji arụ ụlọ. Martin Agba bụ otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ahụ kwuru na ihe gọọmentị kwụrụ ha bụ narị nde naịra itoolu na ụma (N945m) nke bụ ọkara ego ha na gọọmentị kpebiri. N'aka nke ọzọ Mayor Eze bụ onye ndụmọdụ Ihedioha n'okwu gbasara okpuruọchịchị wepụtakwara akwụkwọ ozi iji gọrọ ọnụ ya. Eze kwuru na onweghi otu mkpụrụ eziokwu ọbụla dị n'ebubo ahụ gọọmentị Uzodinma na-ebo Ihedioha. Ọkụ agbaala ụlọọrụ CAC n'Abuja Ụlọọrụ CAC na-agba ọkụ Ọkụ agbaala akụkụ ụfọdụ n'isi ụlọọrụ 'Corporate Affairs Commission' dị n'Abuja. Nke a na-abịa otu izuụka ọkụ gbachara isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego Naịjirịa bụ 'Accountant General' na Bekee. Dịka onyeisi ụlọọrụ CAC bụ Garba Abubakar si kwuo, ya bụ ọkụ emebeghị nnukwu ihe, onweghịkwanụ onye nwụrụ na ya." afirika-45662700,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45662700,"Osun Rerun: Ndị na-atụ vootu eboola ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike","Na agbanyeghị mmiri zoro n'ụtụtụ, ndị mmadụ pụtara n'igwe maka ntụgharị ntuliaka maka ọkwa gọvanọ n'Osun steeti.","E mere ntugharị ntuliaka n'ọnọdụ ịtụ vootu asaa dị n'okpuru ọchịchị Oshogbo,Olodo nakwa Ife-South na Ife-North, Osụn steeti n'ụbọchị. Ndị na-atụ vootu na-ebo ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike , ebe otu PDP na-ebo ebubo wuruwuru. Cheta na Ademola Adeleke nker PDP nwetara vootu 254,698, ebe Gboyega Oyetola nke APC nwetara vootu 254, 345 na ntuliaka gọvanọ e mere na Satode gara aga, nke a mere ka Inec hibe mmegharị na ụfọdụ akụkụ steeti ahụ ebe ha kagbuburu vootu e mere n' ọnọdụ atụm vootu asaa. PDP chọrọ ka agụgharịa vootu nke ụbọchị ụka Dele Adeleke nke PDp ckwuru ka a gụgharịa vootu a tụburu ụbọchị ụka gara aga Dịka a gbakọrọ ịgụ vootu atụkọtara na mmegharị ntuliaka Osun, otu onye nọchịtere otu PDP na Osun bụ Dele Adeleke kwuru ka a gụgharịa vootu a tụrụ na steeti ahụ ụbọchị ụka gara aga. Adeleke kwuru na o nwere 'ihe akwụchaghị ọtọ' na ngụkọ e mere. Mana onye ọrụ Inec nakwa ndị ọrụ pati ndị ọzọ jụrụ ajụ. Onyeisi ọrụ Inec gwara PDp ka ha welie okwu ahụ elu ma ọ bụrụ n'ihe e mere adịghị ha mma.gawa SDP, Omisore na APC Ndị na-atụ vootu na-ebo ndị uweojii ebubo mmekpaahụ, aka ike . Onyeisi otu pati Social Democratic Party (SDP) bụ Olu Falae ewezugala onwe ya na nkwado onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'Osun steeti n'okpuru pati ha nyere ndị APC. Falae kwuru na ya na pati ya na-akwado pati PDP na ntuliaka a ga-emegharị taa na steeti ahụ. Akụkọ na-ekwu na mkpebi Omisore ịkwado APC naanị otu ụbọchi tupu e megharịa ntuliaka n'ụfọdụ ebe na steeti ahụ sotere njem ndị APC mere na be ya. Osun 2018: ""Vootu gị bụ ike gị, ere na ya"" Ndị ahụ gara be ya nke onye ndu ha bụ onyeisi pati APC Adams Oshiomhole gụnyekwara ndị gọvanọ steeti ndị ọzọ na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na pati ahụ. Mana Omisore kwuru na ya kpebiri ịkwado APC agbanyeghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki gara be ya maka na APC kwetara ime ihe ya rịọrọ ha. Cheta na ndị Inec kwuru na ntuliaka e mere n'Osun ụbọchị Sepụtemba 22 ezeughi ezu maka vootu ndị a kagburu akagbu. Inec tinyere ụbọchị taa maka imegharị ntuliaka n'ebe ndị a kagburu vootu ha. Na mbụ pati PDP bụ nke Adeleke nọ na ya zọọ nwtara vootu karịa ndị APC mana maka na vootu ndị akagburu akagbu ka ndịiche dị n'etiti vootu ndị PDP ji aga ndị APC, Inec kpebie na a ga-emegharị ntuliaka ahụ n'ebe ndị ahụ a kagburu akagbu. Ụwa niile na-ele anya ịhụ ihe ga-eme taa na onye ga-apụtazi dịka onye mmeri taa maka na ebe asaa a ga-emegharị ntuliaka a taa, ga-ekwu onye ga-achị Osun steeti afọ anọ na-abịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48237270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48237270,Anambra state: Orụ ndị otu nzuzo akụọla n'aka ndị uweojii,Ihe ruru ụmụ ntorobia iri na itoolu na-ezuike n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka aka ndị uweojii kparala ha.,"N'akwụkọ ozi nke ndị uiweojii ziputere, ọ bụ maka ọrụ otu nzuzo ka eji nwụchị ndị ahụ. Ọ bụ mgbe ha na-achọ ịkpọbata ndị otu ọhụrụ na otu ha n'ịkpa Ukulu dị na Dunukọfịa ka anwụchiri ha. Ụfọdụ ihe ndị a natara ha gụnyere ọtụmọkpọ dị icheiche, mma, ịgba na njirimara otu nzuzo Aye. Ozuolara ndị abalịdịegwu Ndị uweojii na Anambra steeti anwụchiela ụmụnwoke atọ eboro ebubo na ha bụ ndị abali dị egwu na mpaghara Nkpọr n'Anambra steeti. Ndị ahụ anwụchiri bụ Friday Okpe, Peter Ochai na Chukwuebuka Okafor ma kwuo na ha amalitela nyocha banyere okwu ha. Ndị uweojii anwụchiela ndị otu ọjọọ 25 IPOB a na-aba mba na gịnị mere? 30 Mee 1967 bụ ụbọchị agha Biafra na Naịjirịa bidoro Otu Ipob apụtala ịkwu na onweghi onye pụrụ ịmegide iwu ha manyere na ndị mmadụ ga-anọ n'ụlọ iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra. Ọnụ na-ekwuchitere Emma Powerful kwuru na ọ bụ ihe mwute na ọ nwere ndị kwadoro n'ime onwe ha imebi ya bụ ihe. Na mba ofesi Otu meriri na ntuliaka e mere na mba SawỤt Afrịka bụ ANC ekweela ndị mba ahụ nkwa na ha ga-enye ha mbido ọhụrụ. Cyril Ramaphosa na-efe ọkọlọtọ otu ahụ kwekwara nkwa na ọ ga-akpọbata ndị ntorobia n'ụsoro ọchịchị. N'egwregwu, Ohere imeri asọmpị Bundesliga nara Bayern Munich n'iyi dịka ha na otu Red Bull Leipzig gbara onwe ha onye laba onye laba. Gee Nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44749543,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44749543,Dino Melaye: Onye omeiwu ukwu etiela egwu ọzọ,Akụkọ onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia Naịjirịa bụ na Sinetọ Dino Melaye etiela egwu ọzọ.,"Dino Melaye bụ ezigbote onye nkwado onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki Melaye bụ onye omeiwu a ma ama maka ịgụ egwu banyere ihe ọbula ọ na-agabiga, gụru egwu ọzọ na nke o ji na-eto pati ọ nọbu bụ Peoples Democratic Party (PDP), na-asị na ọ chọrọ ịlagachị ebe ahụ. End of Twitter post, 1 Egwu ọ gụrụ bụ egwu eji mara ụmụakwụkwọ, mana Melaye gụgharịrị ya. Egwu Melaye a na ihe ọ pụtara - ịlagachị PDP - abụghị ihe na-atụ ndị mmadụ n'anya makana ọ na-agụbu egwu na mbụ, nakwa ndị mmadu na-echebu na o so n'ime ndị ga-eso na ndị ahụ kewapụrụ na All Progressive Congress (APC), bu ndị a kpọrọ R-APC. N'ọnọdụ ahụ, egwu ya nwereike ịbụ ihe o ji egosi na ọ lagachịla PDP. Ndị mmadụ na Twitter na-etinye ọnụ n'ihe Melaye mere. Ka ụfọdụ na eto ya, ndi ọzọ na-akatọ ya. Gere ha ntị: Onye nwe akara @osatcom jụrụ, ""Ọ bụ gịnị ka anyị mere anyị ji enweta udịrị ndị ọchịchị dị otua?"" @Yobe_Things sara ya sị, ""O si n'aka ọha na-agbara ndị na-achị ha akaebe ma ha mehie."" @hurssle n'onwe ya kwuru na ndị ọchịchị obodo ahụ dị ka ndị na-akpa ọchị, ma kwuo na udịrị ndị ọchịchị dị na Naịjirịa na-egosi na mba ahụ bụ ihe ọchị. @peterukp kwuru na ya enweghi ike ịkpọ Melaye asị, makana o so na ndị ụbụrụ ha dị ọkụ n'ọrụ ọmeiwu. O kwukwara na enweghi ihe dị n'omume Melaye ga-egbochi ya ịnọchịte anya ndị be ya. N'okwu dị ka o mere ka nlaghachị Melaye na PDP bụrụ eziokwu, @officialkolaO bụ onye odeakwukwọ mgbasaozi nke PDP kelere Melaye ma sị ya nnọọ. Ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na Melaye na ndi ọzọ (aha Bukola Saraki, bụ onyeisi ndị omeiwu Naịjirịa, so na ya) nke ahụ abụbeghị ihe edere n'okwute makana ndọrọdọrọ ọchịchị na ndị na-eme ya na-enwe ka ọ na-adị. Ka ndị Igbo na-ekwu ""echi dị ime"". Nke bụ eziokwu bụ site n'etu ndị mmadụ siri mara ya, opụpụ mmadụ dị ka Melaye na APC nwere ike mee ka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 taa pati a na-achị akpụ karịa ma ọ bụrụ na ọ pụghị. Ndị APC enwebeghị ihe ha kwuru maka Melaye, mana ha katọrọ ndị R-APC, ma kwuo na ọ bụ ndị obi adighị mma maka ntuliaka ime ụlọ ha mere iji họpụta ndị ga-achị otu ha mepụtara ya bụ atụmatu ọhụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48957413,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48957413,Imo State: Kedụ etu atụmatụ 'Treasury Single account (TSA) Imo ga-esi rụọ ọrụ?,"Otu onye so na kọmiti hibere Treasury Single Account (TSA) n'Imo steeti bụ Bongo Adi ekwuola na ""atụmatụ TSA ga-enye aka igbochie mpụ na ohi ego steeti Imo.","Ụbọchị Wenezde gọvanọ Imo bụ Emeka Ihedioha wepụtara iwu ọkụ a kpọrọ TSA nke bụ usoro nhazi ego steeti ga-eme ka ego steeti ahụ niile nọrọ n'otu akaraọba ego. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Adi kọwara na kama itinye ego steeti n'akaraọba ego dị icheiche, itinye ya n'otu ebe ga-enye aka ka anya ruo ya otu mgbe. Mgbe a jụrụ ya ma ya bụ atụmatụ a ga-enweta nsogbu n'ọrụ n'Imo steeti, Adi zara na, ""o nweghị nsogbu ọbụla ọ ga-ebute kama ọ ga-enye aka gbochie mpụ na ohi nke dị gbanyụ na gọọmenti pụrụ apụ"". O kwetara na o nwere ike iseghachi ọrụ azụ nwantii, mana ""ọka mma karịa ịhapụ mpụ na ohi ka ochie eze na steeti ahụ"". Adiị gbakwụnyere na ""nke a ga-abara ọhanaeze ndị Imo uru ma gosikwa na gọọmenti a chọrọ ịkwụwa aka ha ọtọ n'ọchịchị ha"". Bongo Adi, onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba bụ onye Site na nke a, gọọmentị ga na- esite ụlọakụ ezipụ ego ọbụla, kama inye ego n'aka n'aka. Onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba gbara ama na a ga-etinye akaraoba ego a n'aka ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ 'Central Bank' bụ ndị ga-elekọta ya anya. Adi onye bụ onye nkuzi na mahadum ama ama bụ Lagos Business School kwuru na ndị mba ndị ọzọ mepere anya na-etinye ya bụ TSA n'ọrụ kemgbe ụwa. Uru dị na TSA Ọgbatauhie so TSA Adi sị na ọ bụ eziokwu na atụmatụ 'TSA' bara ọtụtụ uru mana ọ na-eme ka iwepụta ego n'akpa gọọmentị sitụọ ike maka na ọ ga-eso usoro nke ga-eme ka akwụkwọ sị n'aka fere aka were ruo ndị mmadụ aka. Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ị mata Bongo Adi :Ihe 'Africa Free Trade Agreement' pụtara N'Imo steeti Ọrụ a nyere anyị aka ịchọpụta na Imo steeti nwere akaraọbaego dị ọtụtụ nke mmadụ amachaghị. Adi sị na ""ego di na ụfọdụ akaraọba ego a, ebe ụfọdụ tọgbọ chakoo. Ọtụtụ akaraọbaego ndị a anwụọla agbanyeghị n'ego dịcha na ha."" Lee ihe nkiri ebe a Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53349840,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53349840,Awkuzu SARS: Onye bụ James Nwafor a Obiano si na ya chụrụ n'ọrụ?,"Dịka gọvanọ na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano na-agwa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu ndị uweojii nọ na ngalaba SARS, o kwuru na ya achụọla onye enyamaka ya aha ya bụ James Eze.","Nke na-abịa dịka aha nwa amadị a na-ewu n'etiti ndị ntoroobịa na-eme ngagharịiwe a. N'ime ọnwa ole ma ole gara aga, aha James Eze wukwara na soshal midia Naịjirịa dịka ndị mmadụ kpụkwara ya n'ọnụ. N'oge ahụ, BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ya ihe o nwereike ikwu banyere okwu a na-akpọ ya. N'oge ahu, ekwenti ya agaghị, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra steeti bụ Haruna Mohammed, etinyere ọnụ na ebubo a na-ebo nwa amadi ahụ were kọwa ha ma ya dịka onye narala ezumike nka. Ka Maazị Mohammed kwetere na onye a na-ekwu maka ya bụ onye otu ha nara ezumike nka, ọ gbadokwere ụkwụ na ha enwetebeghị mkpesa banyere ihe a asị na o mere. Ọ sị: ""Ọ bu na soshal midia ka anyị hụrụ akụkọ a. O nwebeghi onye bịara kpesara anyị banyere ya. Ọ bụ e mee mkpesa, amalite ime nyocha mara ka o mere n'eziokwu."" Onye bụ James Nwafor? Angela Okorie na-eme ejije sonyere ngagharịiwe END SARS n'Ebonyi steeti James Nwafor bụ onye Ebonyi steeti, mana ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba SARS n'Ọkụzụ tupu ọ laa ezumike nka. Nchọpụta BBC bu na ọ bụ dịka o lara ezumike nka ka gọvanọ Willie Obiano nyere ya ọkwa na gọọmentị ya. Mana, Komishọna Mgbasaozi n'Anambara bụ Don Adinuba gwara BBC na ya amaghị maka nwoke maọbụ hụtụbe ya anya. Onye bụ onyeisi ndị uweojii n'oge James Nwafor na-arụ ọrụ n'Ọkụzụ bụ Bala Nasarawa. Ọ rụru ọrụ site n'ọnwa Maachị 2012 ruo Ọgọst 2013. James Nwafor lara ezumike nka n'ọrụ ndịuweojii n'afo 2018. Gịnị mere eji chụọ ya n'ọrụ? Willie Obiano sị na a ga-eme nnyocha maka SAR Ọkụzụ Kọmịshọna Adinuba agwaghị BBC oge Maazị Nwafor malitere ọrụ n'ogige Anambara steeti maọbụ ọrụ ọ na-arụ. O kwughikwanu ihe mere ejiri chụọ ya n'ọrụ. Mana. ọ bụ n'ogige ebe ọ na-agwa ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe ka Gọvanọ Obiano kwuru na acgụọla nwa amadị ahụ n'ọrụ. Ọ gịni ka asi na o mere? Ebubo ka nkụ, mana BBC agaghi itinyenwu ọnụ na ha ma ya bụru na anyi anụtaghị n'ọnụ nwoke ahụ. N'agbanyeghị nke a, gọọmentị Anambara enyela iwu ka enyochasịa ebubo niile a na-awụsa n'isi nwa amadị a. N'iwu Naịjirịa, ibo mmadụ ebubo abụghị na mmadu mere ihe ọbụla. Ọ bụ ụlọikpe ka ọ dịrị itinye anya n'ihe mere ma kpebie nke bu eziokwu. Ọtụtụ ebobo a dị na soshal midia, Maazị Haruna Mohammed, dịka ọ na-ekwu na-ekwesighi ị na-etinye ụdịrị okwu na soshal midia rụtụrụ aka na oteela ihe a mere ma sị ajụjụ ihe mere oji bụrụ ugbua ka a na-apalite ihe mere kemgbe 2012 dịkwa mkpa ịjụ. Haruna dọrọ aka na ntị banyere itinye ụdịrị ihe a n'elu soshal midia. #EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata" 42977752,https://www.bbc.com/igbo/42977752,Ụgbọelu DANA ọkaara igbu ndị mmadụ taa?,Ọbere ihe ka ndị mmadụ ji gbanarị ihe mberede ụgbọelu kara igbu ọtụtụ n'ime ha n'Abuja.,"N'afọ 2012, otu ụgbọelu DANA dapụrụ n'elu gbuo ihe ruru mmadụ otu narị na iri ise N'agbanyeghi na ndị otu ụgbọelu DANA gọrọla aka ha na onweghi ihe dị otu ahụ mere ha, ndị nọ n'ime ụgbọelu ahụ kwuputara ọnụ ha ma wepụtakwa foto gosiri na n'eziokwu ọnụụzọ ha fekapụrụ ka ha ka nọ n'ime yabụ ụgbọelu. DANA wepụtara akwụkwọ ndepụta sị ""Ọdịrị ihe a enweghị ike ime maọbụrụ na onyeije ejighi aka ya chọọ imepe ya. ""Etu esi rụọ ọnụụzọ ụgbọelu anyị, onweghị ike ijiri aka ya dapụ ma ọ bụrụ na mmadụ akpaghị ya aka. ""Ndị injinia na ụfọdụ ndị otu Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA) enyochaala ụgbọelu a akpọrọ aha ka o feturu n'Abuja, mana onweghi ihe ọjọọ ha hụrụ. Onwekwaghị ihe ịtụ egwu mere n'oge ọbụla."" Akụkụ ụgbọelu ndị DANA AIR O mere ka o meghị? Lee ihe nkiri na-egosi na ọnụụzọ ahụ fekapụrụ Ihe nkiri na-egosi ọnụụzọ ụgbọala DANA fekapụrụ n'Abuja Otu onye nọ n'ụgbọelu ahụ oge ihe a mere bụ Ola Brown, gara n'igwe okwu Twitter sị Onye ọzọ kwuputakwara na ọ nọ n'ime ụgbọelu ahụ bụ Dapo Sanwo kwuru sị: Ndị ọdụ ụgbọelu Legọsị tinyere ọnụ n'okwu ahụ sị Ihe onye ọbụla na-ajụ ugbu a bụ kedụ nke bụ eziokwu? Ebe ndị DANA na-ekwu na omeghị mana ndị ọmetụtara na-ekwu na o mere eme." afirika-49367926,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49367926,Electricity Generation: 'Ọ bụghị anyị ka enweghị ọkụ latrik si n'aka' - EEDC,Nsogbu enweghị ọkụ latrik na Naijirịa bu ihe gọọmentị Naijiria ka kpụ n'ọnụ ma na-achọ ebe mmiri siri banye n'akị oyibo.,"N'izuụka Ọgọst 16, Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo were ebubo enweghị ọkụ latrik busa n'ụkwụ ụlọ ọrụ n'eke ọkụ latrik na Naịjirịa. Osinbajọ kwụrụ nke a mgbe ọ gara igbape ọdọ ọkụ Latrik nke ndị Niger Delta Power Holding Company (NDPHC) rụrụ n'Abeokuta dị n'Ogun Steeti. O kwuru na na-agbanyeghị na mkpurangwa gọọmentị nwere ugbua nwere ike imepụta ọkụ latrik nke ruru 8,000MW ma bupụ nke rụrụ 7,000MW, mana ihe na-ebe ka na-ebe. Osinbajo kwuru na nsogbu sitere n'aka ndị ụlọ ọrụ na-ekasi ọkụ latrịk nye ọha mmadụ a na-akpọ Discos n'ihi na ngwa orụ ha agaghị ebulị ọkụ latrịk gọọmentị nwere ike ibupụta. O kwuru na nke a mere ha na-ebupụta ọkụ latrik na-ebupụta nanị 4000MW nke ndị na-ekasa ya ga-ebunwu. Emeka Eze sị gọọmentị welite ọkụ latrịk ha dị njikere ikesa ya. BBC gbara ndị Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) ajụjụ maka nkea, ha sitere n'ọnụ Emeka Eze bụ onye na ekwuchitere ha were sị: Kirie ihe ndị EEDC kwuru mbụ EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere Lee akuko ga-amasị gị" media-45443969,https://www.bbc.com/igbo/media-45443969,"FEMA: Ndị bi Abuja, egwu alaọmajijiji atụla ụnụ","Ngalaba na-ahụ maka gbatagbata nke mpaghara Abụja a kpọrọ FCT Emergency Management Agency (FCTFEMA) na Bekee, ekwuola n'ezie na e nwere alaọmajijiji n'isi obodo Naijiria.","Ha rịọrọ ndị bi ebe ahụ ka ha wetuo obi ala, ghara ịgba ọsọ gbakwuru ọdachi. Alaọmajiji mere n'isi ụtụtụ Fraide n'ihe dịka elekere isii nke ụtụtụ dịka o mechara n'abalị abụọ gara aga. O nweghị akụkọ a nụrụla banyere mmebi maọbụ ọdachi ọbụla mana ọtụtụ ndị bi n'Abuja na-eti mkpụ na 'ụlọ ha na akwa ha na-ama jijiji.' End of Twitter post, 1 Na nkọwa ha, @FctFema kwuru na alaọmajijiji ahụ erughị nke ga-ebutenwu ọdachi na Naijiria n'ihi na ala Naijiria anọghị na mpaghara mba na-enwe alaọmajijiji. FCTfema kọwara na ọ bụ mmekpa ahụ metụtara okwute dị n'ime ala nke si n'igwupụta ọnatarachi dị n'ime ala kpatara alaọmajijiji ahụ. Ụzọ ị ga-esi chekwa onwe gị n'alaọmajijiji FCTFema dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji chekwa onwe ha: 1. Dere duu, atụla ụjọ 2. Ọ bụrụ na ị nọ n'ime ụlọobibi, gaa n'ọnụmara nwere ezi nchekwa, tukwuru ala n'okpuru oche maọbụ okpokoro ma jidesie ya ike. 3. Anọla nso na mpio na ihe ndị nwere ike ịda. 4. A kpọkwara oku ka ndị ọrụ gọọmentị lebanye anya n'ihe mere. 5 Ọ bụrụ na ị nọ n'iro, chọọ ebe adịghị nso n'ụlọ maọbụ osisi maọbụ igwe ọkụ na eriri ọkụ latrik. 6. Ọ bụrụ na ị nọ n'ime ụgbọala, kwụsịlata ụgbọ gị ma kwọrọ ya gaa ebe nwere efe, nọrọ n'ime ya were rue oge ọmajijiji ga-akwụsị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43207884,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43207884,Egbuola mmadụ ma gba ụlọ ọkụ n'ogbaghara na Kaduna,"Akụkọ site na Kaduna Steeti na-akọwa n'ihe ruru mmadụ ise anwụọla n'ogbaghara diri n'etiti ndị ụka Kraist na ndị alakọba na gburugburu ebe a na-akpọ Kasuwan Magani, nke dị n'okpuru Kajuru 'Local Government Area'.","Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Agbakwala ụfọdụ ụlọ epere na ụlo obibi ọkụ ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ n'ọgbaaghara a. Ndị mmadụ ka na-alụ uka etu ọgbaghara a siri bido, mana otu akụkọ sịrị na-obidoro mgbe ndị okoroọbia n'ime ndị na-epe ụka Kraist na Kasuwan tiri umụnwaanyị ha ihe maka ha sị na ha na ndị okoroọbịa alakoba na-aghị ọghị, akụkọ ọzọ kwuru n'ọgbaghara a bidoro mgbe asiri gbasara na ndị alakọba n'obobo ahụ achọrọ iji ike me ka ụmụnwaanyị ndị ụka Kraist kpebe Alakọba. Mana, akụkọ ọzọ na-akọwa n'akpọmashị dị n'etiti ndị okwukwe abụọ a na Kasuwan Magani na mbụ tupu ọ bịa n'isi n'ụtụtụ ụnyahu bụ Monde. Kasuwan Magani dị n'ụzọ esi aga Plateau, Nasarawa na Benue Steeti, nakwa ndịda Kaduna Steeti bụ mpaghara steeti ahu ndị uka Kraist kachasị. Ndị si ụzọ ahu agafe tọọrọ ka ọgbahara a na-eme. Aliyu Mukhtar bụ onyeisi ndị uweojii na Kaduna gwara ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ ha gbochiri ogbaghara ahụ ma hụkwa na onweghi nsọbụ dị na Kasuwan Magani ọzọ. O kwuru na ya zipuru onyeisi uweojiii na-ahụ maka ọrụ nchekwa ka ọ ga ebe ihe na-eme ma hụ na orughị ebe ọzọ na steeti ahụ. ""Anyị wetara ozi na nsogbu di na Kasuwa Magani n'utụtụ a. Onye na-ahu maka ọrụ nchekwa n'ụlọọrụ anyi no ebe ahu ugbua. Ndị Mopol nọkwa ya. Ha ncha hụrụ na nsọgbu ọbụla adịghịzi na Kasuwan Magani,"" Mukhtar kwuru. Ọ gara n'iru kwuo na ya enweghi ike ikwu ihe bụtere okwu n'ebe ahụ ma ya bụrụ na ndị uweojii emechaghị nchọpụta. Onye na-achị Kaduna steeti nụ Mazi Nasir el Rufai si ka-ejiri ọsọ ọsọ jide ndị niile aka ha dị n'ogbaghara a. Samuel Aruwan, bu onye na-ekwuchịtere el Rufai, si na ka ọ na-asị ndi ihe a metutara ndo, ọ gwakara ndị ọrụ gbata gbata na Kaduna Steeti ka ha ga-nyere ndị chọrọ enyemaka aka ozugbo. BBC Igbo kpọrọ Emeka Okeiyi bụ onye be ya dị nso n'ebe ihe mere n'ụtụtụ a ka anyi mata etu obodo ahụ dị ugbua. Mazi Okeiyi gwara BBC Igbo na Kaduna dị oyi, na-onweghi nsogbu ọbula dị. Ọsịkwa n'ọgbaghara ụnyahụ abaghị n'ime Kaduna kpomkwem, mana ha nụrụ maka ya n'ehihe mgbe ọgọ ya nwaanyị kpọrọ ha gwa ha n'ahịa Kasuwa Magani enwụrụla ọkụ. Kaduna Steeti so na steeti dị n'ugwu Naịjirịa ebe oghaghara n'etiti ndị uka alakọba na ndị ụka Kraist na-eme kwamgbe kwamgbe. Ọgbaghara nke mere n'afọ 2000 gburu mmadu ruru puku ma me ka-ekewa obodo Kaduna abụọ ka ndị ụka Kraist birizi na ndịda Kaduna, ka ndị ụka Alakọba biri na ugwu ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada" afirika-43666839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43666839,Premiership: Otu di icheiche na-akwadebe agha,Asọmpị na ngwụcha izuụka a bụ ụbọchị asaa n'ime onwa nkea ga-ahu ọtụtụ otu egwuregwu sọ mpi.,"Liverpool na Everton na-azọ okwa onye kachasị oge ọbụla Na Premier League, Liverpool na Everton ga-asọ mpi na elekere iri abụọ na okara nke ehihe. Christal Palace na Bournemouth, Newcastle na Leicester ga-asọmpi n'elekere atọ n'ehihe. Stokecity na Tottenham Hotspur ga-esokwa n'oge ahụ. Asọmpị kachasị mkpa Mana asọmpị ha kachasị atụ anya bụ nke Man City na Man United. Ọ bụrụ na man City merị Man United aga eburu iko Premier League Ha ga-asọ mpi a n'elekere isi na okara nke abalị satọde. Otu ọkachamara n'ihe gbasara egwurugwu bụ Stephen Mbonu gwara BBC Igbo na obi ya kwuru na Man City ga-emerị n'asọmpị a. O kwuru na: ""cheta na Liverpool meri Man City n'ụbọchị abụọ garaaga. Asọmpi a bụ ụzọ ha ga-eji kpanite mmụọ ọzọ"" Man United ha dị njikere? Mbonu kwuru na Lukaku na Pogba bụ ndị ga-enye Man United nsogbu na asọmpị a. N'okwu ọnụ Mbonu: ""ọ bụrụ na Man United lee ihe onyonyo ka Liverpool sịrị merị Man City ha nwere ike ị ma Man City aka ntị n'asọmpị a"" Tottenham na Stokecity Nkea bụ asọmpị ọzọ ndị egwuregwu na-amasị na-atụ anya. Stoke City ga-ejii anya ọnwụ na ndụ sọ mpị a makana ha so na ndị a nwere ike ịgbapu na iko premier league. Mana Tottenham na-agba mbọ ugbua ka ha ba otu anọ kachasị mma makana sọọsọ asọmpi premier league ka ha nọrọ ugbua. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-47192023,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47192023,Man City vs Chelsea: A gwọọla Chelsea ka abacha,Man City ji ọkpụ goolu isii asataghị otu merie Chelsea na be ha n'Etihad taa.,"Raheem Sterling bu ụzọ gbakaa neetị ndị Chelsea, tupu Sergio Kun Aguero abịa gosi ha nke tọrọ fada. Man City gosiri Chelsea na ha anaghị achị ka ha nyere goolu anọ n'ime nkeji 25 e ji malite ịgba bọolụ. Aguero mechara nyezuo goolu atọ nke Bekee kpọrọ ""hattrick"", ebe Sterling nyere abụọ, ebe İlkay Gündoğan nyere otu. Ikpeazụ e ji goolu anọ merie Chelsea n'egwuregwu na Premier League, bụ n'afọ 1996, mana o meela ha ugboro abụọ. End of Twitter post, 1 Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: @Gracey1671 kwuru na e kwesịrị iji maka ụdịrị mmeri a chụọ Sarri n'ọkwa onye nchịkọta. @Etor_Reigns kwuru na ọ ma na isi agaghị apụta Chelsea site n'oge e nyere goolu nke mbụ. @Andre02074138 kwuru sị na ọ dịkwa ka a ga-ebunye Man City iko Carabao karịa ịhapụ ka ha na Chelsea zukọọ n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị a. @_aquosua_ ji foto gosi etu e si wụọ Chelsea n'ala. @Bimpsy sị na iwe ya bụ na ejighi goolu sụpee aha Chelsea. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-44348481,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44348481,Ụmụafọ Igbo ga-agba asọmpi Iko Mba Ụwa,Onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr akpọọla mmadụ iri abụọ na atọ ga-agba asọmpi Iko Mba Ụwa.,"Super Eagles so n'otu n'asọmpi Iko Mba Ụwa Ọtụtụ n'ime ndị a ahọpụtara ga-agbara Naịjirịa bụ ụmụafọ Igbo ebe ndị a ọzọ si mpaghara Naịjirịa dị iche iche. Ụmụafọ Igbo ndị akpọrọ gụnyere ndị na-eche bọọlụ, ndị na-agba ebe azụ, etiti nakwa n'ebe ihu. End of Twitter post, 1 Ndị na-eche bọọlụ; Ikechukwu Ezenwa, Daniel Akpeyi na Francis Uzoho. Ndị na-agba n'azụ; Kenneth Omeruo, Chidozie Awaziem, Tyronne Ebuehi mana nne ya bụ onye bekee. Ndị na-agba n'etiti; Mikel Obi, John Ogu, Wilfred Ndidi na Joel Obi. Ndị na-agba n'ihu; Alex Iwobi, Kelechi Iheanacho, Simeon Nwankwo. Ndị ọzọ akpọrọ aha bụ William Ekong, Leon Balogun, Bryan Idowu, Abdullahi Shehu, Elderson Echiejile, Ogenyi Onazi, Oghenekaro Etebo, Idion Ighalo, Ahmed Musa na Victor Moses. Akukọ ga-amasị gị:" afirika-45186254,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45186254,SARS: Ngalaba a enwetala aha ọhụrụ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ahazigharịala SARS :,"Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua a bụ ihe onyeisi ndị uweojii depụtara n'akara twitter ya maka SARS. N'ọnụ ya, ""Aha ọhụrụ ngalaba a ga-abụzi ''Federal Anti-Robbery Squad(FSARS)."" Ngalaba niile SARS ga-anọ n'okpuru FSARS bidi taa gawa. Idris Depụtara n'akara Facebook ndị Uweojii Naịjirịa na n'ime ọnọdụ ọhụrụ a ahọpụta onye kọmishọna ga-abụzị onyeisi ndị SARS. O kwukwara na ha ghazịgharị SARS maka iwu osote onyeisiala nyere maka ghazigharị ya bụ nagalaba nakwa ka ewee nabata mkpesa ndị Naịjirịa ma gboo y Onye ntọ anwụọla: Ị chetara onye gara ịtọ mmadụ n'Ondo steeti rahụfuo ụra ebe ahụ? Akụkọ kwuru na ọ sila n'ụra fere n'ọnwụ ka ụbọchị itoolu o bidoro ịrahụ ụra maka ọgwụ ike Tramadol ọ ṅụrụ gachara. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla N'etiti ndị APC na PDP: Ụlọ omeiwu Naịjirịa ka nọkwa na mgbachi. Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti Ọ pụtara na ndịomeiwu alagachiteghi dịka onyeisiala riọrọ. Ọzọ na-emekwa bụ na APC na-ebo ndị omeiwu PDP ebubo na ha chọrọ iwakpo ndị omeiwu APC maka okwu Saraki, ha bokwara Saraki ebubo mmegide Obodo. Gụọ akụkọ a n'uju ebea: Nigerian Senate: Kedu ka o si kwụrụ taa? Mba Ofesi: Ihe mgbawa obi emeela na mba Italy taa ka akwa a kpọrọ Morandi dara n'obodo Genoa. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ iri atọ na ise anwụọla ebe ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị ụgbọala ha danyere n'ime mmiri nakwa ndị akwa ahụ dagidere ụlọ ha, merụrụ ahụ. N'egwuregwu: Onye egwu Chelsea bụ Tiemoue Bakayoko, ebinyela aka n'akwụkwọ ga-eme ka o bido ịgba bọọlụ n'Italy. Bakayoko ga-agbara Ac Milan otu afọ, ka ha na Chelsea kwekọrịtara ka ha biri ya. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Benjamin bụ onye ji asụsụ Pidgin na-akọwa bọọlụ oge a gbara asọmpi Iko Mbaụwa, gwara BBC Igbo etu o si bido. Benjamin: Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ" 46360319,https://www.bbc.com/igbo/46360319,Nigeria Election 2019: Achịcha na onyinye ndị ọzọ e ji arịọ maka vootu gị,"Oge onyinye ọkụkọ, achịcha, mkpọ machis, ncha, akpa osikapa na mmanụ nri oruola ọzo?","Ihe oriri anaghị akọ n'onyinye ndị ndọrọndọrọ ji arịọ vootu Onye ọbụla maara na Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka 2019 ga-ebido na Febụwarị 23. Oge ntuliaka na Naịjirịa bụ oge ndị na-azọ ọkwa ọchịchị n'okpuru pati dị iche iche na-enye onyinye ka o si masị ha. Dịka ị ga-achọpụta n'ime akụkọ a, ụfọdụ onyinye a nwere ike ịgbagwoju gị anya nakwa bute ọchị maọbụ nnukwu iwe n'obi gị. Lee onyinye ise pụrụiche ndị na-azọ ọkwa ọchịchị nyere ndị na-akwado ha n'ime ntuliaka gara aga na Naịjirịa. Achịcha (Bread) Oluwarotimi Akeredolu bụ gọvanọ Ondo steeti bụ onye foto ya dị n'elu achịcha a. N'ahịa, a na-ere ụdịrị achịcha a otu narị naira (N100); ike ka ọ ga-eji ju gị afọ ma ọ bụrụ na ị bụ nwoke. Mana ọ bụ ihe ndị Naịjirịa bi n'Ondo steeti hụrụ dịka onyinye ibinyere otu APC aka na ntuliaka e ji họpụta gọvanọ steeti ahụ na Nọvemba 2016. Igwe mmadụ natara achịcha a n'agbanyeghị na onweghi onye maara n'ezie onye bidoro inye ya bụ onyinye. Oluwarotimi Akeredolu mechara merie ma bụrụ gọvanọ. Nri 'Indomie' Nke a mere n'Anambra steeti na ntuliaka gọvanọ nke afọ 2013. Otu ""All Progressive Grand Aliance (APGA)"" mechara merie na ngwụcha ntuliaka a. Nke a bụkwa ọzọ mere n'ọnwa Maachị n'afọ 2015 na ntuliaka ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa. ‏@Hitee_ kọwara na ọ bụ ndị otu PDP mabanyere nri a n'ime ụgbọala ya na Legọs. Baro (Wheelbarrow) Nke a malitere na Benue steeti. Dịka egwuregwu, ndị Benue steeti n'afọ 2017, nụrụ na gọvanọ ha bụ Samuel Ortom na-ekesa baro dịka ọpụpa na steeti ahụ. Nke a butere nnukwu ọchị n'elu soshal midia. Mana Ortom kwuru na onyinye baro a bụ maka ikwado ndị ntorobia na steeti ahụ. Mana ndị mmadụ ekwetaghị na nke a, ha na-ekwu na ọ bụ maka Ortom chọrọ iso n'ọsọ ntuliaka 2019 dịka gọvanọ steeti ahụ. Igwe okwu (radio) Shehu Sani bụ sinetọ na-anọchite anya Kaduna sentral n'okpuru otu APC. Onweghi onye maara n'ezie oge e setere foto a, mana akụkọ pụtara na soshal midia mgbe ahụ kọwara na oteghi aka Ortom bidoro ikesara baro, ka Sani bidoro ikesa igwe okwu nke ya. Dịka onyinye ndị ọzọ, nke a bụtere nnukwu ọchị n'elu soshal midia. Akwụkwọ e ji etinye ego n'ekwentị (recharge cards) Onyinye a malitere na Legọs ma bụrụkwa nke a kachasị kesaa dịka onyinye ịrịọ maka ịtụ vootu. Na Legọs n'afọ ahụ, ọtụtu mmadụ kwetere na ha natara onyinye a. Ka a tụchara ntuliaka ahụ, APC bụ ndị nwetara mmeri. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51233284,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51233284,"Imo governorship Judgement : Ihe mere ụlọikpe kachasị jiri wụọ Ihedioha n'ala, mee Uzodinma Gọvanọ",Ụlọikpe kachasị ewepụtala akwụkwọ maka ikpe ha kpere nke mere ka ha ji chụpụ Emeka Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma dịka Gọvanọ Imo steeti.,"Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ na ya bụ akwụkwọ ikpe bụ; 1. Na ndị okaiwu Hope Uzodinma gbara akwụkwọ gosipụtara akwụkwọ nke ha jiri gosi mpụta n'ọgbọ atụmvootu dị narị atọ iri isii na isii n'Imo steeti. 2. Ndị okaiwu Emeka Ihedioha egosighị ihe igba ama ga-egosi na akwụkwọ mpụta ntụliaka ndị okaiwu Hope Uzodinma ji bụ ""adigboroja"" dịka ha siri kwuo. 3. Akwụkwọ ndị uweojii nke gosiri mpụta ntụliaka na ọgbọ 366 ndịa gosiri na nke ndị Okaiwu Hope Uzodinma jị bụ eziokwu. 4. Ndị Inec eweteghị ihe igbaama ga-egosi na akwụkwọ ọkaiwu Uzodinma ji abụghị nke ezigbo ya. 5. Ụlọikpe Kachasi sitere n'ikike iwu Naijirịa nyere ha were nye Hope Uzodinma ọchịchị Gọvanọ Imo steeti n'ihi na Ọkaiwu Emeka Ihedioha na ndị Inec enweghị ihe Igba ama gosiri na ikpe Hope Uzodinma gbara enweghi isi. Ọkaiwu bụ Ugo Egbujo kọwara BBC ihe mere ikpe jịrị gaa etu o siri gaa - Akwụkwọ Hope Uzodinma gbara megide Emeka Ihedioha Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpu Hope Uzodinma na ndị Okaiwu ya jiri bia ikpe Ihe Emeka Ihedioha na ndị Okaiwu ya jiri bịa ikpe Ndị ọkaiwu Emeka Ihedioha kwuru sị na ihe mere INEC anabataghị mpụta ntụliaka ndịa bụ maka na enweghị ntụliaka ọbụla emere ebe ahụ. Ihe INEC kwụrụ maka ikpe ndị okaiwu Hope Uzodinma gbara Ndị ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijirịa bụ Independent NAtional Election Committee (INEC) sị na ha anabataghị akwụkwọ mpụta Hope Uzodinma jiri bia n'ihi na emeghị ntụlịaka ọbụla n'ebe ndị ahụ. Etu ikpe siri gaa n'ụlọikpe mkpegharị Hope ụzodinma na ndị okaiwu ya jị akwụkwo ha sị na ọ bụ mpụta ntụliaka emere n'ọgbọ ntụliaka 388. Ulọikpe gwara ha ka ha kpota ndị ọrụ INEC ndị rụru ọrụ na ọgbo ntụliaka ndịa ahụ ka ha kwuo na ọ bụ eziokwu na emere ntụliaka n'ebe ndị ahụ. Kama naanị mmadụ iri abụo na itolu n'ime narị atọ na iri asatọ na asato rụru ọrụ ebe ahụ. Ma sịkwa na ndi uweojii ha kporo kwesịrị ịkpọ ndị uweojii niile no n'ebe ndi ahu ka ha bia kwuo ka ọ sịrị gaa. Ụlọikpe ndịa sị na ọbụghị nanị Komishọna ndi uweojii Imo steeti ga-ekwuchitere ndi uweojii ahụ. Ihe merziri ụlọikpe kachasị jiri nyefee Hope Uzodinma ọchichi gọvanmọ Imo steeti Ụlọikpe kachasi si na ekwesịghị ikpota ndị ọrụ INEC rụru ọrụ n'ọgbọ ntụliaka ndị ahu na ọ dịri INEC iwepụta akwụkwọ mpụta ntụliaka ahụ ma ọ bụru na ha sị na nke Uzodinma ji bu adigboroja. Dịka ndi INEC na adoola azu maka iwepụta ya bu akwụkwo, ndị uweojii wepụtara akwụkwo ntụliaka nke ha. Uloikpe kachasi chọpụtara na o bụ otu ihe na nke Hope Uzodinma weputara. Emeka Ihedioha na ndi okaiwu ya eweputaghi akwụkwọ mpụta ntụliaka nke ga-egosi na nke Uzodinma bụ asị. Dịka ndi INEC na ndị okaiwu Emeka Ihedioha enweghi ike iwepụta akwụkwọ mpụta ya bụ ntụliaka, ụloikpe kachasị gbebiri na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ya bu ntụliaka. Ụlọikpe kachasị meziri Hope Uzodinma Gọvanọ Imo steeti." afirika-56867512,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56867512,"ESN vs Ebubeagu: ""Anyị kwadoro ndị ọbụla pụtara ichekwa ala Igbo"" - Ohaneze Ndị Igbo",Otu Ohaneze Ndigbo etiela mkpụ na ndị agha Naijirịa na-anwụchi ndị ntoroọbịa n'ala Igbo na nzuzo ọkachasị n'obodo Ohaji na Ugwuta dị n'Imo steeti.,"Ha katọkwara nnwụchi a na-anwụchi ndị otu Ipob na Eastern Security Network na enweghị ngwaọgụ a hụrụ n'aka maọbụ ihe gosiri na aka ha ịdị na mpụ. Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere otu a bụ Alex Ogbonnia gwara BBC na ọ bụ ihe ọ gụtara n'akụkọ ma na-ajụ, "" Enwere ihe dị njo ndị agha a hụrụ ndị ntoroọbịa anyị na-eme ha jiri kpọchie ha? Ọ dịghị mma"". O kwukwara kama na enweghị onye jidere gọvanọ Bala Mohammed oge o kwuru ka ndị ọchị ehi buru egbe na-agagharị. Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN' Enyinnia kwuru na ha chetakwa na mba Ingland ekwuola na ha ga-anabata ndị otu Ipob a na-emegbu na Naijirịa nke mere na ụmụ ntoroọbịa Igbo nwereike ịgbaga mba Ingland. Gịnị ka Ohaneze nwere ikwu maka iwu mmachi ngagharị na ntuliaka Nnamdi Kanu nyere? Ogbannia kwuru sị "" ihe Ohaneze na-agwa Nnamdi Kanu bụ ya mee ka ya na ndị nna na-akpa nkata tupu ekwuo ihe ga-eme. Mana ịkuli tie iwu ihe ga-eme; mbanụ, ọ bụrụ etu e si eme."" Ọ kọwara na onwereike ọbụrụ na ihe o jiri tie ya bụ iwu bụ ihe ziri ezi kama ekwesịrị ịkpa ya akpa. Kedụ maka ESN na ebube agụ? Alex Ogbonnia kọwara na ọ bụ ọrụ gọọmentị ka ọ dịịrị ichekwa obodo. O kwuru sị"" anyị enweghị nsogbu ọbụla gbasara otu ọbụla na-echekwa obodo, kama ọnye ọ bụ ọrụ ha ichekwa ma ndị Ipob na ndị ESN bụ ndị gọọmentị"". Ọ kọwara na onye ọbụla kwadoro ịchekwa ala igbo abụghị ihe ọjọọ. Ogbonnia kwuru sị, "" Ndị bụ ndị Ipob maọbụ ESN bụ ndị Igbo, umụ okoroboa anyị. Anyị chọrọ ka ụmụ okorobia na-echekwa ala anyị. ọ bụ ihe anyị choro, ọ bụ ihe ọma""." afirika-46750632,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46750632,Burna Boy: Gịnị gbasara Coachella na ụmụ Naịjirịa?,Emume ịgụ egwu nke mba Amerịka a kpọrọ 'Coachella Valley Music and Arts Festival' na-eme n'ọkpa Colorado bu otu emume dị ukwu.,"N'ime nke afọ a, ndị otiegwu Naịjirịa abụọ bụ Burna Boy nakwa Mr. Eazi ga-esonye na ndị ga-agụ egwu na ya bụ emume. Ihe a mere na ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi ọṅụ ha gbasara ya bụ okwu. JAGS kwuru na ha abụọ bụ ndị Naịjirịa gara ya bụ emume. End of Twitter post, 1 Tema_JayZ kwuru na ọ bụ ihe ọma mere Afrịka niile. Gịnị butere eseomkwu dị n'ime ya? Burna boy bụ otu n'ime ndị otiegwu ahụ bụ Burna Boy nọ na mmiriọkụ ugbua dịika ndị mmadụ na-akatọ ya maka okwu okwuru. Ọ gwara ndị coachella na mkpụrụ edemede ejiri depụta aha ya na foto mgbasa ozi ha pere mpe ma sịkwa ha ha gbaa mbọ lebanye anya na ya. SulAF jiri foto Mourinho gosi uche ya gbasara ya bụ okwu. Ebe Timi kwuru na onweghị ihe ọjọọ ọ hụrụ Burna Boy mere maka okwu ya Ụfọdụ mmadụ jiri aka ha dere Burna Boy aha ya n'akara edemede ukwu Rue ugbua Coachella asabeghị Burna Boy okwu maọbụ gbanwee akara ha jiri dee aha ya na foto mgbasa ozi ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50158925,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50158925,Enugu state Fire Service: Ụdị ọkụ gbara n'Onitsha agaghị eme n'Enugu makana anyị dị njikere,Ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti ekwuola na ha dị njikere ịgbanyụ ụdịrị ọkụ ọbụla n'ihi na akụrụngwa ha ji arụ ọrụ zuru oke.,"Onye isi ụlọọrụ steeti ahụ bụ Okwudili Ohha, gwara BBC Igbo na ụlọọrụ ha nwere nnukwu ụgbọala mgbanyụ ọkụ iri na abụọ na tanker abụọ na-ebu mmiri, nke mmiri juru n'ime ha chere echere oge ọbụla. Ohha kwuru na udịrị ọdachị ọkụ ọgbụgba mmanụ ụgbọala mere n'Ọnịcha apụghị ime n'Enugwu n'ihi na ha kere nkwụcha oge niile. Ohha kọwara na ha nwekwara tanka na-enyere aka ma mmiri gwụwa. Iji zaa ajụjụ maka ụgbọala tanka bụ mmanụ mebiri na New Artisan n'Enugwu abalị abụọ gara aga, ọ kọwara na ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ụlọọrụ ya jiri kemikalụ wee kwụsị ya bụ mmanụ na-awụsasị n'ala ịghọrọ ọkụ. Dịka Ohha kwuru, ọ karịala ugboro isii ụgbọala bu mmanụ ụgbọala nwere nsogbu n'Enugwu n'ime otu afọ, mana onweghị nke ghọrọ ọkụ n'ihi nkwụcha ụlọọrụ ha kere n'Enugwu. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Onitsha fire: ""Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?" afirika-45485102,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45485102,NCDC: Anyị na ụlọọrụ ahụike UK na-enyocha mmadụ abụọ bụbara ọrịa 'monkeypox' na Britain,"Kamgbe a chọpụtara mmadụ abụọ na-arịa ọrịa 'monkey pox' na London, ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa a kpọrọ ""Nigeria Centre for Disease Control"" nakwa ụlọọrụ ahụike na-enyocha ya bụ ọrịa.","Kamgbe Septemba nke afọ 2017 Monkey Pox batara Naijirịa, ihe ruru mmadụ 262 ebutela ya bụ ọrịa. NCDC kwuru na ha na ndị ọchịchị steeti dị iche iche na Naịjirịa jikọtara aka inyocha ma gbochie ya bụ ọrịa ""Monkey pox"" ịgbasasị n'obodo. 'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola' NCDC kwukwara na ha na otu dika WHO, UNICEF nakwa ndị ọzọ na-ahụ maka ahụike mbaụwa niile na-ezukọ izuụka ọbụla iji wepụta ụzo dị iche iche a ga-esi gbochie ya bụ ọrịa ""Monkey pox"". Gini bụ Monkey pox Dịka NCDC si depụta n'akwụkwọ ozi ha wepụtara nso nso a, ọ na-adị mkpa ịkpachapurụ ndị nọ n'ọnọdụ a anya ma mee ka ndị mmadụ na-adị ọcha site n'iwere mmiri na ncha kwọọ aka. Ụlọọrụ NCDC kwukwara na ha ga-eme ihe niile ha nwereike ime iji wee hụ na ha nyochara ma chọpụta ndị bu ya bụ ọrịa ""Monkey pox"". Ha rịọro ka onye ọrụ ahụike ọbụla chọpụtara onye bu ọrịa ""Monkey pox"" gwa ndị na-arụ n'ụlọọgwu na-ahụ maka anụahụ na steeti ahụ ka ha wee mara ihe ha ga-eme. NCDC nyere akara websait a ''https://ncdc.gov.ng/diseases/guidelines.'' dika ebe mmadụ nwereike ịga nweta etu ọ ga-esi gbochie maọbụ gwọo ọrịa ""Monkey Pox."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54442839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54442839,Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo,Asari Dokubo akọwaarala BBC Igbo ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ na mmekọrịta ya na onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.,"Ọ sị na Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra, na o nweghi onye ọbụla ọ na-edu nwereike ime ka e nwete Biafra. Ọ sị na ozutebeghi Kanu ihunihu, kama ọ bụ n'ekwenti ka ha abụọ na-akpa. O kwukwara na mgbe Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ, na o so na ndị gbara mbọ ịhụ na a tọhapụrụ ya. Dokubo kwuru na ihe seere ya na Kanu okwu bụ mgbe Kanu sị ka ndị Igbo gbajọọ iso mee ntuliaka n'afọ 2019, mana ọ gwara ya mba na etu a adịghị mma. ""Agwara m Kanu na ọ bụ site n'ime ntuliaka ka a ga-eji chụpụ Onyeisiala Buhari n'ọchịchị mana Kanu nupuruisi ma kpọsa m asị."" Dokubo gara n'ihu tinye ọnụ n'ebubo Kanu boro ya maka ị nara ya nde naịra iri abụọ ma jụọ Kanu ""kedụ mgbe nke a mere""? Ọkaiwu Nnamdị Kanu bụ Aloy Ejimakor sị na Kanu maọbụ ya onwe ya enweghi ọsịsa ha ga-enye Dokubo n'okwu ndị o kwuru. Ejimakor sị na Dokubo bụ mmadụ nkịtị nwereike ikwu ihe ọbụla dị ya n'uche. Kirie ihe ha kwuru n'uju n'elu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47837724,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47837724,Junaid Mohammed: Ihe ise dị mkpa o kwuru maka ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria,Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo akatọọla Junaidu Mohammed maka ịkwu na ọkwa Onyeisiala akaghị erute Ndigbo aka n'afọ 2019 sị na ọ bụ mmegbu.,"Junaid Mohammed, onye bụbu onye nnọchịteanya n'Ụlọomeiwu Nta kwuru na mkparịtaụka ya n'akwụkwọ ntaakụkọ, Sun, nwere ụbọchị Satọde, kwuru na atụmatụ ị na-eke ọkwa onyeisiala onye o ruru ọ chịa, akụsala. O kwukwara na ebe ndị Ugwu Naijiria nwere mbu, nwe nfụ iji nweta ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Mana ndị nwere agba n'Igbo na-ekwu n' okwu ya akwụghị ọtọ. Onyeisi otu Njikọ Igbo Forum bụ Rev Okechukwu Obioha kwuru na mmegbu dị na ya. Okechukwu Obioha bụ onye isi otu Njikọ Igbo ""Mba ọ dịghị mma, mmegbu dị na ya."" ""Ọ bụrụ na a gbasowe usoro onye o ruru, ọ chịa, kemgbe 1999 rue 2023, ọ bụ naanị ndị Ọwụwa-Anyanwụ bụ ndị achịbeghị."" ""E kwesịrị iji 2013 medaa Ndigbo chọrọ Biafra obi."" ""E mere ya ndị Yoroba were Obasanjo tie ha aka n'obi maka MKO, were Jonathan tie ndị Niger-Delta n'obi maka ọgbaghara ndị mba mmiri."" Ịsa Junaid okwu dịka iji egbe agba nwa nza- Nnia Nwodo N'okwu ya, onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru na inye Junaid ọsịsa dịka iji egbe agba nwa nza. ""Ọ naghị ata okwu eze tupu o kwuo ya."" Nwodo gara n'ihu kwuo na 2023 ka tere aka ibido kwuwe maka ya. Ndigbo azụwala okwe maka 2023- Udeze ""Ndigbo abịaghị ile ihe nkiri na Naijria."" Kenneth Udeze bụ odeakwụkwọ otu jịkọrọ otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị (CUPP) kwuru na, ""Onye sị Ndigbo agaghị ewere ọchịchị na 20123 gaa laba hiwe ụra."" ""N'ihi na Igbo na-azụ okwe etu anyị ga-ezi weghar ọchịchị."" Udeze onye bụkwa onyeisioche otu pati AA sị, ""Ndigbo abịaghị ile ihe nkiri na Naijria."" Cheta na tupu e me ntuliaka 2019, ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC kwuru na Ọwụwa-Anyanwụ na Ọdịda-Anyanwụ kwere ndị be ha ṅkwa na a ga-enye ha ọkwa onyeisial n'afọ 2023 ma ọ bụrụ na ha tụnyere Buhari. Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Sun nwere ụbọchị Satọde, Mohammed na Ndigbo na-atụụ naanị onwe ha vootu ma chọọ ka ndị ọzọ tụnyere ha. Ọ sị, ""Lee ndị si ọwụwa anynwụ na ntuliaka ikpeazụ e mere , ha niile tụrụ Atiku, ma na-atụ anya na ndị ọzọ ga-esi ebe ọzọ tụnyere ha."" Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị ọzọ tụnyere gị, ga chọọ ndị Naijiria ị ga-akwụnyere. Ikekwa, na afọ 2023, Kanu ga-apụta manye ndị Naijiria ndị ọzọ ha tụnyere ha. Ocụ̄ichị onyekwuo uche ya bụ inyem, ma eneye gị."" ""Lee ihe na-eme ugbua, anyị ebiddola agba nke abụọ ọchịchị Buhari, ndị mmadụ azọwala 2023, ndị Yoroba sị nọ bụ ha ka o ruru. Ka o si ruo ha, amaghị m."" Leee ọkwụ ndị ọzọ o kwuru : 2. Etu ntuliaka 2019 siri gaa ejughị mafọ n'ihi ọgbaghara so ya na agwa ndị ọ bụ ọrụ ha ịhazi ntuliaka. O wechighara elekere ọchịchị onye kwuoucheya azụ 3. Atiku maa na ya dara ntuliaka e mere. O nwere ikike dịka Iwu siri kwuo ịgba akwụkwọ n'ụlọikpe mana ụzọ o si achụ ya bụ okwu ga-emebi ihe 4.Ekwenyeghị ma ọchịchị Muhammadu Buhari n'agba a ga-adị iche na nke mbụ 5. O nweghị mgbe m rịọrọ Buhari ọkwa ( n'ọsịsa ajụjụ na ihe ọ ji akatọ Buharị bụ maka na onye ghị ọkwa) Akụkọ ga-amasị" afirika-50387183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50387183,Nigeria vs Benin: Ihe bụ iwe ndị mmadụ ka a gbachara egwuregwu Naịjirịa na Benin,N'abalị Wenzde ka otu Super Eagles ji ọkpụ goolu abụọ merie Squirrels ndị Benin Republic mana ọkwụsịghị ebe ahụ.,Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa gara n'elu soshal midia jiri #ShameonNTA ịgosi iwe ha maka etu Nigerian Television Authority (NTA) si gosipụta ya bụ asọmpị. Kedụzịa ihe ụmụ Naịjirịa tụrụ anya ịhụ n'asọmpị nke NTA gosiri n'igwe onyonyo ha? Etu ihe onyonyo si di Ụfọdụ n'ime ha tụrụ anya na agwa Kamera ha ga-adị karịa ihe ha hụrụ ụnyaahụ. Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ dụka Fmk Abiola kwuo na Kamera ekwentị iPhone ka ya mma. Etu esi kọwaa ya bụ asọmpị Ihe ọzọ wuru ewu bụ maka ụfọdụ ihe onye na-akọwa asọmpị ahụ bụ 'Commentator' na Bekee kwuru. Odogwu kwuru na commentator nke ahụ na-enye akụkọ ezighi ezi. Ihe ndị ọzọ mmadụ na-ekwu bụ na NTA gosiri na ihe anaghị arụ ọrụ na Naịjirịa ka o kwesiri dịka Samsaon Gbenga kwuru. Caleb Winful kwuru na ọ bụ oke nka bụ nsogbu NTA. Akụkọ ga-amasị gị afirika-49916769,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49916769,"Isaac Promise, ọgba bọọlụ Naịjirịa, alaala mmụọ n'afọ iri atọ na otu",Ihe anya mmiri emekwaala ọzọ n'egwuregwu bọọlụ Naịjiria.,"Isaac Promise Isaac Promise, onye gbaara Naịjiria bọọlụ n'oge gara aga, alaala mmụọ. Otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' kwuputara nke a n'akara 'Twitter' ha na uhuruchi ụbọchị Tọzde. End of Twitter post, 1 Promise nwụrụ na mgbede Wenezdee na be ya dị na Austin, Texas nke mba Amerịka. Akụkọ kọrọ na ọ gharịpụrụ na mberede n'ime ụlọ ebe ọ na-anọ agbatị ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ 'Gym'. Promise gaara agba afọ iri atọ na abụọ n'abalị abụọ nke ọnwa Disemba afọ a. Ndị otu Austin Bold FC bụ ebe Promise nọ ugbua ekwuputakwala maka ọnwụ ya. Tupu ọ gaa Amerịka, Promise gbara bọọlụ ọtụtụ afọ na mba Tọkị ebe ọ gbaara otu dị iche iche. Ha gunyere Trabzonspor, Karabükspor, Antalyaspor na ndị ọzọ. Ndị Austin Bold FC ekwuputala maka ọnwụ Isaac Promise. Promise bụ onye ji mgbaaka 'captain' mgbe Naịjiria gara asọmpi bọọlụ nke Beijing Olympics' n'afọ 2008. Naịjirịa ritere ọla ọcha na ya bụ asọmpi n'afọ ahụ. E mechara kpọọ Promise n'otu ndị 'Super Eagles' n'afọ 2009. O so ha gbaa bọọlụ naanị ugboro atọ ma nye otu goolu. Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari na onyeisiala Saụt Afrịka, Cyril Ramaphosa Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwela nkwa na ya ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji gbochie mwakpo ndị mbịarambịara na mba ahụ. Ramaphosa kwere nkwa a oge ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwechara nzute n'ụbọchị Tọzdee. Mana Ramaphosa kwukwara na ọbụghị naanị ndị Naịjirịa ka a wakporo oge ọgbaaghara 'Xenophobia' dapụtara n'oge gara aga. Ya bụ ọdachi metụtakwara ọtụtụ ndị mba ọzọ tinyekwara ụfọdụ ndị Saụt Afrịka, dịka Ramaphosa si kwuo. Na akwụkwọ ozi nke ha zipuru dịka ha nwechara nzute ha, ndịisiala abụọ a kwuru na mmekọrịta Naịjirịa na Saụt Afrịka ka kwụsiri ike. N'aka nke ọzọ, Buhari kelere Ramaphosa maka nnabata ọ nabatara ya. Ọ katọkwara mwakpo ahụ a wakporo ụmụ Naịjiria n'oge gara aga. Mana ọ gbarụkwara ihu maka ụlọahịa ndị Saụt Afrịka e mebiri na Naịjirịa iji bọọ ọbọ maka mwakpo 'Xenophobia'. Mgbọ atụọla ndị Ipob mmadụ abụọ na Saụt Afrịka Ndị uweojii mba Saụt Afrịka achụsaala ndị otu Ipob bịara ịme ngagharịwi maka Onyeisiala Muhammadu Buhari bịara ebe ahụ. Otu n'ime ndịisi Ipob n'Abuja bụ Reverend Peace gwara BBC Igbo na mgbọ tụrụ mmadụ abụọ. Peace kwuru na ọbụ ezigbo mgbọ ka ndị uweojii gbara ha. Mana ihe onyoonyoo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri na ọbụ mgbọ rọba ka a gbara na ngagharịiwe ahụ. Na France N'ofesi, ndị uweojii na France egbuola otu onye ji mma magbuo mmadụ anọ n'isiụlọọrụ ha dị na Paris. Nke a na-eme dịka ndị uweojii mba ahụ gbachara abụbụọrụ maka ajọanya ndị mmadụ na-arọ ha nakwa oke mwakpo a na-eme ha. Ndị okaiwu mba ahụ sị na ha amalitela ịma imi n'ala iji ịmata ebe mmiri sị banye opi ụgbọgụrụ. Lig ndị Yuropu Na Lig nke Yuropu, ndị Arsenal na Standard Liege ga-ezute ebe Manchester United na AZ Alkmaar ga esumpi na elekere asatọ nke abali a. Ndị ọzọ ga-akwata taa bụ RZ Pellets WAC na FC Roma, Besiktas na Wolves na ndị ọzọ. Anya ga-ewetere gi nchịkọta ya mgbe oge ruru. Ndị omekome n'Imo steeti Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ihe ruru mmadụ iri bụ ndị na-akpa mkpamkpa ọjọọ na steeti ahụ Ha gunyere ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị na-ere ọgwụ ike, ndị na-egbu mmadụ, ndị na-awakpo nwaanyị nakwa ndị na-atọrọ ụmụaka. Mmadụ abụọ n'ime ndị anwụchiri bụ ụmụnwaanyị ebe ndị ọzọ bụ ụmụ nwoke. Ihe anatara ndị omekome N'ofesi Mba Amerịka agbapeela ụlọ mmekọ ha na mba Somalia bụ nke ha gbachiri kemgbe afọ 1991 mgbe agha dara na mba ahụ. Amerịka kwuru na ha mere nke a iji kwado ọdịnma ha na ndị Somalia nakwa ịwụlite udo na mpaghara ahụ. N'egwuregwu, Otu egwu bọọlụ Naịjirịa adabala n'ọgbọ dị ọkụ ka ahọpụtara ndi ha ga-ezute n'asọmpị AFCON nke ndị obere. Eagles ga-ezute Mali Cameroon nakwa mba Ghana n'ọnwa Nọvemba. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-52420473,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52420473,Coronavirus Live tracker: Lee eserese na-egosi ka ọrịa a si emetụta mba ụwa niile,Pịa ebe a ka ị hụ ebe coronavirus kachasị emetụta ndị mmadụ n'ụwa.,"Ka coronavirus na-emetụta mba ụwa niile Eseela Ndị a hụrụ nwere corona n'ụwa niile Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Ebee o si: Mahadum Johns Hopkins, ndị isi mba ahụike na mba Akara mgbe ekwusọrọ ya 4 Disemba 2020, 10:27 GMT+1 data n'uju *Mmadụ ole nwụru kwa otu puku Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Maapụ a na-egosi ọnụọgụ nke ndị Mahadum Johns Hopkins na-edepụta kwa mgbe kwa mgbe, onwereike ghara igosicha ka ihe siri kwuru ugbua na mba ụfọdụ. **Ozi ikpeazụ ndị ọhụrụ bu ọrịa a bụ ngụkọ nke ụbọchị atọ. N'ihi ntụgharị n'ọgụọgụgụ ndị bu ya, ọ gaghị adị mfe ịgbakọ nke ụbọchị a. Ebee o si: Mahadum Johns Hopkins, ndị isi mba ahụike na mba Mgbe edere akara: 4 Disemba 2020, 10:27 GMT+1 I kwesịrị inwe tekịnụzụ JavaScript ọgbara ọhụrụ na ịntanet siri ike iji mepee ihe mkparịtaụka a. Kedụ etu ọrụ gị si ghere oghere? Ghere oghe nye ọrịa Nso nye ndị ọzọ Ngọpụrụonwe Ozi banyere 'ohere ibute ọrịa n'ụlọọrụ na etu ndị mmadụ ji nọrọ onwe ha nso' sitere n'ajụjụọnụ a jụrụ ndị ọrụ n'Amerịka tupu ọrịa Covid-19 na atụmatụ mmadụ ịnọpụrụ onwe ya amalite. Ọrụ ndị e depụtara ebe a nwereike ọ bụghị ndị gbapụtara ihe n'ụfọdụ mpaghara n'ụwa." afirika-43110008,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43110008,Buhari: Kedu ka Ị ga-esi nyere Naijiria aka?,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akpọkuola ndị Naịjirịa niile, ọkachasị ndi ọnụ na-eru n'okwu, ka ha dị nkwado ichụ aja nke ga-enye aka mee ka Naịjiria too.","Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Buhari kwuru okwu a na Daura n'ụbọchị ụka mgbe ya na ndị a kpọrọ ""Katsina Senior Citizens"" nwere nzukọ. Ọ gakwara n'ihu wee kwuo na ndụ mba ọbụla, a na-enwe mgbe ndị mmadụ kwesiri ịchụ aja ma ha chọ ka obodo ga n'ihu. Onyeisiala gwara ndị otu ndị gọvanọ nke a kpọrọ ""Governors Forum"" na bekee nke Gọvanọ Katsina steeti bụ Aminu Masari duru bịa si: ""Naịjiria nke oge anyị chọrọ ka ndị be anyi niile were gbaputa ya n'ime mpụ na aghụghọ, ọkpa na-agaghi n'iru."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Buhari kwere otu ndị gọvanọ nkwa na nchekwa mmadụ na akụnụba ndị Naịjirịa niile ga na-enweta mgbado anya ya ọfụma. Ka ọ na-asa ya, Govanọ Masari sị na ndi otu ya bịara be Buhari mgbaru maka mmadụ abụọ nwụrụ na be ya. Ha kenekwara onyeisiala maka mberede okporoụzọ metụtara nwa ya nwoke bụ Yusuf." afirika-49398179,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49398179,FIBA World Cup: O nwere ike ịkwa otu bọọlụ nkata Nigeria bụ 'D'Tigers'?,Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ nkata Naịjirịa a kpọrọ D'Tigers bụ Alex Nwora ekwuola na ndị otu ya atọọla na Naịjirịa n'ihi ụkọ ego.,"Nwora kwuru na agbanyeghi na otu ha bụ ndị mbụ n'itozuoke n'asọmpi Iko mba mana ha agabeghi Chaịna n'ihi ụkọ, na nke a nwereike ime ka ha gbajọọ asọmpi a. D'Tigers dịka e si a kpọ ha bụ otu kachasị akụ bọọlụ nkata n'Afrịka ma bụrụ ndị nke asatọ n'ụwa (FIBA Power Ranking). Asọmpi Iko Mbaụwa bọọlụ nkata a bụ nke ugboro atọ nakwa nke mbụ ha kamgbe afọ 2006. Ha nwere ndị ọkụ bọọlụ a ma ama dịka Al Farouq Aminu nke Orlando Magic, Ekpe Udoh nke Utah Jazz, Josh Okogie nke Minnesota Timberwolves, na Ike Diogu onye na-akụrụ Golden State Warriors. Dịka ọ dị ugbua, Naịjirịa enweghi mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu dịka onyeisiala Buhari edubeghi ndị mịnịsta ya n'iyi ọrụ kamgbe ọ bara ọchịchị nke abụọ. BBC kpọtụrụ onye Direktọ mịnịstrị egwuregwu. Onweghi ihe o kwuru kama ọ sị ka a jụọ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nkata bụ NBA. BBC na-agba mbọ inwete ọsịsa n'aka ndị a mana onwebeghi nke nwere isi. Nke a emeela ka ọtụtụ n'ime ndị na-akụ bọọlụ ji ekwuputa uche ha na soshal midia. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55749581,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55749581,Ipob asaala George Obiozor nke Ohanaeze Ndigbo maka okwu ọ gwara Nnamdi Kanu,Ndị ọkaiwu Ipob gụnyere Aloy Ejimakor na Paul Achalla asaala onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor n'okwu ọ gwara Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob.,"Obiozor mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Enugwu sị na ""Okwu Biafra karịrị Nnamdi Kanu ikpebi"". Na nzaghachị ndị ọkaiwu Ipob katọọrọ ihe Obiozor kwuru mgbe ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ekwentị. Aloy Ejimakor sị na ọ tụghị anya na Obiozor ga-ekwu ụdị okwu a maka na Nnamdi Kanu abụghị obere nwa, na ọ karịala afọ iri ise. Ọ sị na okwu Biafra abụghị ihe gbasara Ohanaeze Ndigbo maka na ha abụghị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama na ọ bụ otu omenala na-ahụ maka ọ dị mma ndị Igbo. Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe Ipob nwere megide onyeisi ọhụrụ Ohanaeze Ndigbo kama na ha ekwesighị ị na-akpụ Ipob na Kanu n'ọnụ mgbe niile. N'okwu nke ya, Paul Achalla sị na Obiozor hapụrụ ihe o kwesịrị ikwu metụtara mmegbu ndị Igbo, mwakpo ndị Fulani na-achị ehi nakwa nchekwa n'ala Igbo ma kwuwe maka Biafra na Ipob. Achalla kwukwara na Nnamdi akwụghị naanị na mbọ inwete Biafra na ọtụtụ ndị Igbo nwere agba so ya n'azụ. Ọ gara n'ihu kwuo na Ohanaeze bụ ọgbakọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si ala Igbo ji ala ezumike nka na ha na anaghị eme ihe ga-abara ndị Igbo uru. Achalla nyere Obiozor ndụmọdụ ka ọ hapụ ịgbaso ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma lekwasị anya maka ọ dị mma ndị ntoroọbịa, ndị nne nakwa Igbo gbaa gburugburu. Ihe ndị ọzọ Obiozor kwuru:" 53780344,https://www.bbc.com/igbo/53780344,Kamsiyo Agbasianya: Ndị ntọ atọrọla nwata afọ ise na Nnewi ka ọ na-aga 'block rosary',"Ndị a maghị ndị ha bụ atọrọla otu nwata gbara afọ ise aha ya bụ Kamsiyo Agbasianya, na Nnewi, Anambara steeti.","Joseph Meka bụ nna Kamsiyo, gwara BBC Igbo n'ekwenti na ""ọ bụ ka ya na ibe ya gara ekpere 'Block Rosary' na mgbede Tuzde"" ka ụmụnwoke bu ọgbatumtum, tọọrọ ọdụdụ nwa ya dịka ya na ibe ya so aga, buru ya gbalaga. Nwoke ahụ bụ onye Obiagụ dị n'Uruagụ, Nnewi gwara BBC Igbo na ndị ji nwa ha akpọbeghị ha dịka o kwukwara na ha ewegarala ndị uweojii mkpesa maka ihe mere. Mgbe BBC Igbo kpọrọ ndị uweojii n'ekwentị, ha kwuru na ha na-agbalị ịchọta nwa ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru sị ""anyị ga-eme ihe niile ị me ka nwa a na ezianụlọ ya zụkọọ onwe ha ọzọ."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43337623,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43337623,World Cup ga-ekene ndị ọrụ BBC na Lagos,"Dịka iko a sị eme njem, o rutela na Lagos bụ isi obodo ochie Naijiria.","Ndị na-eso egwuregwu bọọlụ ga-enwe ohere ị hụ ịko a na ndụ Iko nke a e ji ọlaedo were rụpụta ga-abia njem n'ụlọọrụ BBC dị na Lagos n'ehihe tata ka ọ kụrụ Elekere Atọ(3:00pm) tupu e buru ya ga Teslim Balogun Stadium dị na Surulere, Lagos. Chebiri anyi na BBC News Igbo peeg maka Facebook Live dịka anyị ga-egosi gị ka o si aga. A ga kwa e nwe mmemme a ga-emere ya n'ụlọoriri bụ Eko Hotels, ebe a ga-enye kwa ndị mmadụ ritere ya ohere ịhụ ịkọ na ndụ n'ụtụtụ ụbọchị Satọday na mbara Tafawa Balewa. Iko FIFA a kwadoro ịga njem mba ruru iri ise na otu ndị tozuru ịga asọmpị ya a ga-eme n'afọ a na Russia. Naịjiria so na mba ndị tozuru ịgba asọmpị iko mba ụwa n'afọ a Chetanụ na iko a batara Naịjiria ụbọchị Wenesde ma kenekwa onyeisiala Muhammadu Buhari. Ọ ga-ahụpa Naịjiria na mgbede Satọde, ebe a ga-ebughachi ya Russia n'ọnwa Julaị. Nke a ga-eme ugboro anọ ọ na-aga njem ụwa ma ugboro atọ ọ na-abịakwa ala Naịjiria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 53117205,https://www.bbc.com/igbo/53117205,Tottenham vs Man United: Ha abụọ eshitela otu pọịntị n'ajọ ọnwụ,"Ndị Tottenham ji otu ọkpụ goolu sị ndị Manchester United ""nnọọ"" dịka ha nabatara ha n'azụ ụlọ ha, mana Man Utd mechara zọta isi onwe ha.","Goolu ndị Tottenham si n'aka Steven Bergwijn na nkeji 27 e ji malite ya bụ egwuregwu, gosiri Man Utd na Jose Mourinho bụbu onye nchịkọta ha anabataghị ha n'ụlọ ọhụrụ ya ka ọ gbaa ha nkiri. N'agbanyeghị na ọ bụ a gbatu gbatu a ṅụọ mmiri, otu abụọ a nwara ike ha ịma ndị ga-azọta pọịntị mgbe a ga-egbuchi bọọlụ. Na nkeji 81, Bruno Fernandes ji penariti nyere Man Utd goolu dịka Eric Dier kwaturu Paul Pogba, mere ka ọ bụrụ onye lawa onye lawa. Mwebata e webatara Pogba gbanwere egwu ndị Man Utd, mee ka ha kpawakwa ike. Na nkeji 78, e webatara Odion Ighalo bụ nwaafọ Naijiria na-eme ndị mmadụ obiọma nso nso a, mana ọ gbaghị aka ahịa ruo mgbe e gbuchiri bọọlụ. Na nkeji 90 na ụma, ndị Man Utd tikwara mkpu ka e nye ha penariti oge ọ bịara dị ka Dier ọ gbaturu Bruno, mana ihe nkiri enyemaka Video Assistant Referee (VAR) nyochara ya sị na otu abụghị n'ezi. Cheta na mgbe otu abụọ a zutere tupu ọrịa Coronavirus achụkpuo onye ọbụla n'ime ụlọ, Man Utd ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Tottenham n'Old Trafford. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50025394,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50025394,Ebonyi State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara na steeti a,"Nchọpụta kwuru na Ebonyi steeti so na steeti kacha daa ụbịam na Naịjirịa , mana nke ahụ nwere ike ịgbanwe n'oge na-adịghị anya.","Galena Nke a bụ maka na steeti ahụ nwere ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi nke ha nwere ike ileba anya na ya iji bugharịa ọnọdụ obodo ha. Ka anyị leba anya na ụfọdụ n'ime ha dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si kwupụta: 1) 'Nnu (Salt)' Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Ebọnyị nwere oshimiri ndị gbara ya gburugburu nke nnu bara ụba n'ime ya. Ụmụnwaanyị ndị ime obodo n'Ebọnyị nwere ụzọ ọdịnala ha si ewepụta nnu n'ime mmiri oshimiri. Mana ọ dịịrị gọọmentị ileba anya ịmata ụzọ ọgbara ọhụrụ nakwa Teknụzụ nke nwereike ime ka mmepụta nnu bawanye ma na-ewetawanye nnukwu ego. Nnu bara ụba na mpaghara Afikpo North nakwa Ohaozara. Ewepụ na e ji nnu esi nri, ihe ndị ọzọ ejikwa ya eme buru ibu. Ha gụnyere nke bekee kpọrọ 'dyeing' na 'bleaching' dgz. 2) 'Galena' Galena Galena bụ okwute ojii a na-egwupụta n'ime ala. Ọ na-adị ka nke bekee kpọrọ 'lead', mana ya na 'lead' abụghị otu ihe. A na ahụkwa kịrịrị ọla ọcha n'ime Galena, nke mere ọnụ ahịa ji adị elu. A na-ere otu tọn Galena otu puku dọla, narị asaa na iri abụọ. E ji 'Galena' arụpụta ihe na-enye ụgbọala maọbụ igwe ekwentị ike nke a kpọrọ 'battery' Akụkụ Afikpo North na South nwere Galena n'ụbara. 3) 'Limestone' Igwe e ji akwọri 'limestone' Limestone bụkwa nkume ọcha e ji emepụta ntụ e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'cement'. E jikwa ya emepụta 'Marble'. O juru eju na mpaghara dị iche iche n'Ebọnyị. Ha gụnyere, Abakiliki, Ishielu, Afikpo North na South, nakwa Ohaozara. 4) 'Granite' Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu Granite bụ nkume siri ike na-acha ọcha. Mana enwekwara ụdị granite na-eji oji. Ọ bụ ịrụ ụlọ, akwa mmiri, nakwa ịchọ ụlọ mma ka e ji ya eme. Ị gaa na mpaghara Ivo, Ọnicha, Afikpo, Ebonyi nakwa Ohaozara, ebe ahụ ka e nwere granite n'uju. 5) 'Marble' E ji 'marble' achọ ụlọ mma dị ọgọ Marble bụ nkume na-esi na 'Limestone' dị ọkụ apụta. Ọkụ ala nwere ịkụ ghekpọọ 'limestone' n'ime ala, mezie ya ka ọ ghọọ marble, dịka ndị ọkacha mara si kwuo. E ji marble a arụ ụlọ, jirikwa ya achọ ụlọ mma. E jikwa ya akpụ ihe ọkpụ dị iche iche. Marble na-ada oke ọnụ ahịa. Abakiliki, Afikpo na Ohaozara bụ mpaghara Ebọnyị e nwere Marble. 6) 'Laterite' E ji laterite arụ ụzọ Bụ aja ụrọ na-acha mmeemmee. Ihe e ji ya emepụta dị ọtụtụ dịka ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. E ji ya emekwa nkume pụrụ iche e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'Bricks. Na mpaghara Afikpo ka a na-enweta 'laterite' nke kacha mma. 7) 'Ball Clay' 'Ball clay' bụ ụdị aja ụrọ na-acha ọcha. E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics'. ""Ceramics' bụ ihe e ji emepụta ihe dị ịcheiche dịka efere nakwa iko a chọrọ mma, na-akụwa akụwa. E jikwa ya akpụpụta ihe ndị e ji achọ ụlọ mma. Ọbụ n'akụkụ osimiri ka a na-enwetakarị ya. N'akụkụ ụfọdụ n'Afikpo South ka e nwere 'Ball Clay'. 8) 'Shale' 'Shale bụ okwụte ojii si n'aja ụrọ apụta. Ọ bara urunke ukwuu maka mmepụta 'cement', 'ceramics', 'tile' nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. A na-agawakọ 'shale' na 'limestone' iji mepụta 'cement' Na mpaghara Ọnịcha ka e nwere 'shale' n'Ebọnyị steeti. Ebonyi bụkwa otu steeti na Naijiria e ji ịkọpụta osikapa mara. Osikapa Abakiliki magburu onwe ya ma na adakwa ụda n'Afrịka niile. Ihe ndị a nwere ike inye aka ka Ebọnyi steeti wulie akụnụba ha. Ihe nkiri ga-amasị gị: Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru" afirika-44837409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44837409,'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa,Ndị agha Naịjirịa ekwuola na akụkọ kwuru na a wakporo ndị agha na Bama dị na Boronu steeti ma nara ha ụgbọ agha ha bụ asị.,"Oteela ndị agha Naịjirịa jị awakpo ndị Boko Haram Ha depụtara ihe a n'akwụkwọ sitere n'oche ọnye na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa ọnụ bụ Texas Chukwu. Ha kwuru na ya bụ akụkọ na-edughie ndị mmadụ ma bụrụkwa nke e gbasasiri karịa ihe merenụ. Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha ji ohere a ekwe ndị bị n'ugwu Awụsa nkwa na onweghị ihe mebirinụ kama nchekwa ha ka kwụ chim. Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na Boko Haram wakporo ha ma chọkwa ịnara ha ngwaagha ha mana ndị agha Naịjirịa meriri ha. Ha kwuru na ha gburu ihe ruru ndị otu Boko Haram 22, ebe ụfọdụ ndị egbe a gbara agba meruru ahụ gbara ọsọ. Ndị agha Naịjirịa kwuru na etu ọ dị ụgbua, na ha na-agba mbọ ịhụ na e jidere ndị otu Boko Haram ndị ọzọ gbara ọsọ. Ha kwukwara na ndị agha meruru ahụ site n'egbe a gbara ha mana ha na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Ndị agha Naịjirịa dọkwara ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya ha maka ịdughịe ndị mmadụ n'akụkọ ha enyochaghị enyocha. Cheta na akụkọ anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na ndị Boko Haram anwuchiela ndị Naịjirịa 600 ma napụ ha ngwa agha ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45032443,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45032443,A nwụchiela nwoke tụnyere nwa ya ime ma jụ na ọ gaghị alụ di,"Aka ndị uweojii akparala nwoke metọrọ nwa ya nwayọọ afọ asatọ kemgbe nwunye ya nwụrụ ma tụnye ya ime, nwa dị afọ atọ ugbua.","Onye a na-ebo ebubo Julius Ochim onye Krọs Riva bi na Shagamụ bidoro metọwa nwa ya nwaanyị ka ọ dị afọ 13 n'afọ 2009 ka nwunye ya nwụchara rute oge ọ tụwara nwa ya ime ka ọ dị afọ 18. O buru afọ ime ahụ mụọ ya afọ atọ gara aga. Nwata nwaanyị ahụ boro ebubo na nna ya na-eji omenala emewa ya kwa ya ihe ga-eme ya ma ọ bụrụ na ọ jụ idina ya. Mana nsogbu dapụtara ka otu nwoke gosiri mmasị ya ịnụ nwa ya ahụ dịzị afọ 21. Ochim gbara isi akwara, na-aba, na egbu mma n'ala na ọ gaghị eme. Arịrịọ niile ndị metụtara ha rịọrọ nwoke a ka o nye ohere ka nwa ya lụọ di dịka ịgbasa mmiri n'okwute. Nke a mere ka nwa ya ga kpesara ndị uwe ojii n'ogige nke Shagamu. N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ogun steeti ebe mkpamkpa kpara bụ Abimbola Oyeyemi, kwuru na anwụchiri nwooke ahụ ka nwa ya wetachara mkpesa na nna ya na emetọọ ya kemgbe afọ 2009 nne ya jiri nwụọ. Ya tụrụ ime,mụta nwa dị afọ atọ ugbua. Ọ gara n'ihu kwuo na Ochim kwetere n'ebubo eboro ya bụ eziokwu ma sị na ọ bụ ọrụ ekwensu. O kwukwara na ihe kpatara ya ji jụ ka nwa ya lụọ dị bụ ya ya nwe ohere ga n'ihu idina ya. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kachiri ya ganye oge ha ga-emecha nyocha ma kpụpụ ya ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45584734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45584734,Kedụ etu ndịagha Naịjirịa abụọ si nwụọ?,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndịagha Naịjirịa abụọ nwụrụ n'ehihie ụbọchị Wenezday n'obodo Gwoza na Borno steeti.,"Ụlọ ntaakụkọ Premium Times na-akọwa na ọ bụ otu n'ime ndịagha abụọ ahụ gburu onwe ya ma gbukwa onyeagha ibe ya. Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo Ha gakwara ihu kpọpụta aha onyeagha ahụ ka Adegor Okpako na onye ọzọ nwụrụ dịka naanị ""Saka"". Mana ndịagha Naịjirịa esila n'akara Twitter ha kwuo na ọ bụ ihe ọdachi riri ndụ mmadụ abụọ ahụ. Ha kwukwara na ọ bụ mgbe a na-akuziri ha ihe ka mgbọ amaghị ụma gbapụ nke bụ 'accidental discharge' gburu ndị ahụ. Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ nke Premium Times kwuru na mmadụ anọ ọzọ merụrụ ahụ mgbe Okpako malitere ịwụ mgbọ ebe niile. Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-eme okwu a nyocha ziri ezi iji ghọta ihe butere ya bụ mwakpo. Akụkọ ga-amasị gị" 43268769,https://www.bbc.com/igbo/43268769,Ọkụ agbala ahịa Timbershed n'Enugwu,"Ọkụ ọgbụgba ahụ bidoro n'abalị ụnyaahụ gbawa, ma rue taa.","Ahịa Timbershade dị n'Enugwu agbala ọkụ Mkpu akwa na ita ikikiri eze bụ nke na-ada na ya bụ ahịa n'ihi na ndị ahịa kwuru na ihe ha ji akpata ego agbapịala ghọrọ unyi na ntụ. BBC Igbo rutere na ya bu Timbershade dị n'agbata Maryland dị n'Uwani, Enugwu, wee hụ na ya bụ ọkụ repịara Line 2 na Line 3 dị n'ahia ahụ nke ndị nwe ya ewepụtaghị ọbụladị otu ihe tupu ya bụ ọkụ erepịasịa ha. Ahịa Timbershade dị n'Enugwu agbala ọkụ Onye ode akwụkwọ otu ndị ahịa osisi bụ Enugwu Timber Union bụ Gilbert Nweke gwara BBC n'ebe ya onwe ya na-ere osisi gbapịakwara tọtọ nke na ya amaghịzị otu ya n'uwa ya ga-esi mee. O tiri mkpu na ngalaba na-agbanyụ oku n'Enugwu steeti bụ Enugwu State Fire Service na bekee arụghị ọrụ ha ọfụma. Ọ sịrị na ha abịaghị n'oge wee gbanyuo ya bụ ọkụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị ọzọkwa na-azu ahịa na Timbershade ọdachi a dakwasara gụnyere Charles Eze, Tony Aja, Chukwunonso Nnamchi, Joseph Eze, Ifeanyi Eze, nakwa Tuface nwa Chineke kwuru na ha amaghị ihe kpatara ọkụ ahụ bụ nke ha kọwara na ọdịzị ka ọ bụ kwa afọ ka ọkụ ji emerụ ha ahụ nke ukwuu. Ha rịọrọ gọọmenti ka o nyere ha aka ruo ụlọ ajaụpa esiri esi nke a kpọrọ 'bricks' n'ahia ahụ niile, ma tinye igwe na- agbanyụ ọkụ na transformer iji wee gbochie ọdachi a n'ọdịnihu. Azụmahịa dịzị ka a ga-asi na ọ kwụsịrị na Timbershade,ndị ọ metụtara na-ajụ ihe ha ga-eme. Ebe ndị ometụghị na- asi, 'ọ bụkwaranu m?'" afirika-43597734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43597734,'Afrịka ga-akọ akụkọ ndị Afrịka' - Mo Abudu,Ihe ọhụrụ na-abịa n'ụlọọrụ ihe nkiri nke EbonyLife TV.,"Mark Young (Sony TV), Mo Abudu (Ebony Life TV) na Kunle Falodun Akụkọ sị ụlọọrụ a kwuru na Ebony Life na Sony TV, bụ ụlọọorụ ihe nkiri nke ala bekee, ebinyeela aka n'akwụkwọ maka imekọ ihe n'ime ọrụ ihe nkiri. N'ime akwụkwọ ozi Ebony Life zipuru ndị ntaakụkọ, ha kwuru na nke a bụ nke mbụ ụlọọrụ ihe nkiri nke ala Naijirịa na Sony ga-ebinye aka na akwụkwọ imekọ ihe. Ihe a pụtara na Ebony na Sony ga-ebido ihe nkiri dị icheiche. Ha kwuru na ugbua a mụpụtala ihe onyonyo atọ nke ọhụrụ. Otu n'ime ihe nkiri a nke akpọrọ 'Dahomey Warriors' na bekee. Onyeisi Ebony Life bụ Mo Abodo kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na kemgbe amụpụtara ụlọọrụ Ebony Life n'afọ 2013, ihe kachasị dị ya mpka bụ ị gbanwee etu ala ndị ọzọ sịrị hụ mba Afrịka. 'Fifty' so na ihe nkiri ọhụrụ Ebony Life TV mụpụtara O kwuru, ""Ihe m chọrọ bụ ka anyị bụ ndị ụmụafọ Afrịka bụrụ ndị ga-akọ akụkọ anyị ka anyị sịrị chọ."" Akụkọ ga-amasị gị Mo kwuru na obi na-atọ ya ụtọ, na akụkọ di icheiche sị mba Afrịka ga-erute mba ụwa niile maka mbinye aka a mere. Uru o nyere Nollywood Nollywood bụ otu na-eme ihe nkiri gbasara Naịjirịa na Afrịka nke amaama na mba ụwa. Ụlọọrụ dịka Ebony Life TV enyeela otu a n'ịkwado nke ọma, makana ọtụtụ ihe nkiri amụpụtara mere ka ụwa mara maka Nollywood nke oma, dịka ihe nkiri 'Wedding Party', 'Fifty na Royal Hybiscus Hotel'. Nollywood na-eso Bollywood nke ala Idia na Hollywood nke ala Amerika n'ọrụ ihe nkiri Wedding party na Royal Hybiscus Hotel pụtara na mmemme gbasara ihe nkiri ha na-eme na Toronto n'obodo Canada. Na afọ 2014, gọọmentị Naịjirịa kwuru na Nollywood bụ otu ruru ijeri dọla atọ. Ọrụ ka dị Ndị ohi akpọrọ pirates na bekee ka na-emebi ọrụ ndị ihe nkiri na Nollywood. Otu akpọrọ National Bureau of Statistics deree na sọọsọ otu percent n'ime ijere dọlas atọ na ba aka ndị nwere ihe nkiri a." media-47918944,https://www.bbc.com/igbo/media-47918944,Kedụ ihe mere Mofe Duncan na nwunye ya ji gbakụta onwe ha azụ?,Onye ihe nkiri ama ama bụ Mofe Duncan na ya nwunye bụ Jessica Kakkad achịsala ọwa n'ihe gbasara alumdinanwunye ha ka afọ atọ gachara ha jiri lụọ.,"Duncan, onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Instagram ya ụbọchị Fraide kwuru na o ruola otu afọ ga gbasara kama na ezinaụlọ ha abụọ ka dị na mma. Ọ gara n'ihu kele ndị na-akwado ya. End of Instagram post, 1 Jessica kelekwara ndị ihe ya na-amasị maka nkwado ha. Duncan bụ onye ihe nkiri riterela nzere maka ihe nkiri o merela. Ihe nkiri Duncan onye Delta steeti merela gụnyere Ovys Voice, Sons of the Caliphate na Three Kings. Jessica Kakkad onye nna ya bụ onye Indịa mana nne ya bụ onye Edo bi na Lọndọn ebe di ya nọ na Naijiria tupu ụgbọ ha akụkasịa. Duncan na Jessica oge ndụ na-atọ ha ka nnu Ebe ụfọdụ ndị ihe ha na-amasị na-ekpere ha ekpere ọma, ndị ọzọ na-ata ha ụta. Kepukepu na-ekwu nsogbu dị na etiti ha agbaala afọ mana ha abụọ enweghi onye kpọrọ okwu aha were rụọ n'izu a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49460153,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49460153,Enugu Kidnapping: O nweghi onye tọọrọ m kama a gara m n'ụlọ enyi m nwoke - Nwaada Anioma,Ndị uweojii Enugwu anwụchiela otu nwata nwaanyị asị na a tọọrọ mana ọ bụrụ na ọ gara n'ụlọ enyi ya nwoke.,"Nke a dị n'ime akụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Ebere Amaraizu zitere BBC Igbo. Nwata a kpọrọ Kosisochukwu Anioma bụ nwa Frank Anioma onye bụbu onyeisioche okpuruọchịchị Nkanu East dị n'Enugwu Steeti sị na onweghi mgbe a tọọrọ ya. Kama na ọ hapụrụ Enugwu n'ụtụtụ Tọzde abalị 22 Ọgọst, 2019 gawa n'Owere Imo Steeti ịhụ enyi ya nwoke bụ Oluehi Somtochukwu. O kwuru na onweghi onye ọ gwara na n'ụlọ ha na ọ na-eme njem gawa Owere n'ụbọchị ahụ. N'okwu ya 'Eji m aka m hapụ ụlọ anya dị n'Enugwu ma gawa Owere ịhụ enyi m nwoke, onweghi onye tọọrọ m, onwekwanụghị onye ga-atọọrọ m."" Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị afọ iri na atọ ma nọọrọ klaasị nke atọ n'ụlọakwụkwọ 'Command' Sekọndịrị dị n'Abakaliki Ebonyi Steeti. Kosisochukwu kwuru na ya na enyi nwoke nọ n'otu klassị n'ụlọakwụkwọ ahụ. Cheta na akụkọ pụtara nke na-ekwu na nna ya sị na ndị omekaome tọọrọ ya n'ụbọchị abụọ gara aga. Mgbachị Ihedioha nkịtị - Okorocha gwara Onyeisi ndị uweojii Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti Aka chiburu Imo bụ Rochas Okorocha agwala onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ ghara itinye anya n'akwụkwọ mkpesa Gọvanọ Emeka Ihedioha dere banyere ya. Site n'ọnụ onye enyemaka ya bụ Sam Onwuemeodo, Okorocha sị na mgbesa ndị ahụ eneghi ebe mbakwasị ụkwụ. N'ofesi Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Honkong dịka ọ banuere ọgbaghara na mmerụ ahụ. Mana ọfụdu n'ime ndị a na-eme ngagharịiwe nọ na-ama okwute nke butere ndị uweojii ji achụ ha. N'egwuregwu N'egwuregwu Crystal Palace ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu zọọl Manchester United aja n'ụlọ ha Old Trafford. N'aka nke ọzọ Chelsea nwetere mmeri mbụ ha n'asọmpi Premier site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Norwich City. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 46963340,https://www.bbc.com/igbo/46963340,Obasanjo's letters: Ndị isiala chịrị Naijiria Obasanjo jiri edemede leta degide,"Onye chịbuuru Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, abụrụla okwu akpụ n'ọnụ ugbu a dịka ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria siri dị.","A marala nwa amadị a dịka onye anaghị asọ eze anya tupu ọ gwa ya okwu. O jirila mkpịsị odee ya were menye ụfọdụ ndị chịrị Naijiria ụjọ n'anya, bụkwa nke mechara chụpụ ụfọdụ n'ime ha n'ọkwa. Ndị isiala ahụ bụ ndị a: Alhaji Shehu Shagari: Onye a chịrị Naijiria site n'afọ 1979 - 1983, bụ onye mbụ Obasanjọ bu ụzọ menyụọ anya site n'edemede leta ọdegaara ya mgbe e duchara ya n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ dịka onyeisiala n'ọnwa Ọktoba 1, 1983. Ozugbo oweere oche dịka onyeisiala nke ugboro abụọ, Obasanjọ pụtara ihie ma katọọ ọchịchị ya bụ nke nọchiri anya ya dịka onyeisiala, ma kọwaa ya dịka nke na-agba ọnyụpa n'okwu akụnaụba, ma bụrụkwa nke tinyere ụmụ Naijiria n'oke ụbịa m. O nyekwara mkpesa banyere etu mpụ si bawanye na Naijiria. Nke a nyere aka ma kpọbata ndị agha n'ọchịchị. IBB ejighị ahụ. Ibrahim Babangida: Nwa amadị a chịrị Naijiria dịka onye agha bụ onye nke abụọ mkpịsị odee Ọbaasanjo metụtara. Nke a bidoro mgbe ọchịchị ahụ wepụtara atụmatụ e ji ebelata ụbịam a kpọro 'Structural Adjustment Programme' (SAP) n'aha bekee. A kọwara nke a dịka atụmatụ mere ka ụbịam bawanye. Nke a mekwara ka Obasanjọ gaa n'ihu n'ịgba ọchịchị ahụ ụkwụ ruo na ngwụcha ya. Abacha nwụrụ na ọche ka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1998 Sani Abacha: N'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ nọọrọ na-atụ ọchịchị ndị agha nke Sani Abacha nọ n'isi ya ụjọ, Obasanjo gakwara n'ihu ma gosi ya onye ọ bụ mgbe ọ nọọrọ n'otu ụlọ ọgbakọ Arewa katọọ ọchịchị Abacha, ma kọwaa ya dịka nke kpuru isi. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ BBC nwere n'oge ahụ, Obasanjo boro ọchịchị Abacha ebubo irikpọ akụnaụba Naijiria dịka onye ọkwọụgbọ mmiri mmanya na-egbu. Abacha mere ya ka ọma n' ọnya, bụ nke mere e ji tụọ ya mkpọrọ. Ọ nọọrọ n'ụlọmkpọrọ rue mgbe Abdulsalami Abubakar weghara oche ọchịchị dịka Abacha nwụchara. Ọ bubuuru onyeisiala Naijiria Umaru Musa Yar'Adua: Ọchịchị a weghara oche dịka Ọbasanjo chịchara afọ asatọ mgbe ọchịchị ọhakarasi lọghachịtara n'afọ 1999. Mana adị m na mma Obasanjo na Yar'Adua bidoro dawa aja aja ozugbo nwaamadị a hụtara na ọchịchị Yar'Adua na-agba ọnyụpa Obasanjo kwupụtara uche ya n'edemede odere sị, ''Dịka ịma, n'ọnwa ole na ole na-abịa, a ga-ewe ọchịchị gị dịka nke n'ọnọdụ ndapụ nke ọchịchị Obasanjo, ma eleba anya n'ọnọdụ wetara gị n'ọchịchị. Ọ bụ ya mere ị ga-eji gbalịsia ike ma wepụtara onwe gị nakwa ọchịchị gị njirimara pụrụ iche''. Goodluck Jonathan: Oge Yar'Adua nwụrụ n'ọkwa n'afọ 2010, osote ya bụ Goodluck Jonathan banyere n' ọkwa onyeisiala. N'ime afọ abụọ e duchara ya n'iyiọrụ dịka a họpụtachara ya n'afọ 2011, nsogbu ya na Ọbasanjọ bidoro. N'edemede leta o degaara ya bụ nke ọ kpọrọ ''Tupu Oge Agaa'', Obasanjo kwuru na o mere ka ọhaneze mata nke a n'ihi na od egarala Jonathan akwụkwọ a ugboro anọ, bụkwanụ nke ọ zaghachighị. O kwuru, ''Ọnọdụ obodo a ugbu a nakwa ihe nwere ike ịbụ mpụtara ya mere m jiri n'ekwu tupu ụzọ emechie n'ihe gbasara ịkwalite adịm mma obodo anyị, ma gwa gị na egwu nọ n'ụzọ''. Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Muhammadu Buhari: Onyeisiala na-achị Naijiria ugbu a bụ Muhammadu Buhari, bụkwa onye nwetara nkwado pụrụ iche site n'aka Obasanjo n'afọ 2015, hụtakwara akparamagwa nwaamadị a dịka odee akwụkwọ ozi na 2018 n'ime afọ atọ ọ nọọrọ n'ọkwa n'ọchịchị. Ọ gwara ya ka ọ kwụsị echiche ya ịzọgharị ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, n'ihi na aka ọrụ ya kemgbe ojiri weghara ọchịchị, akụdala mụọ ndị Naijiria, bụ ndị tụnyeere ya vootu n'afọ 2015. Obasanjo edegara Buhari akwụkwo ozi ugboro abụọ. Na mkparitaụka ya na BBC nwere n'ọnwa Jenụwarị, 2019, Obasanjo kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala, ma kwupụtakwa nkwado ya nye Atiku Abubakar nke otu pati PDP. Akụkọ ga-amasị gị:" 43696629,https://www.bbc.com/igbo/43696629,Ntuliaka 2019: Buhari ekwuola na ọ ga-azọ ọzọ,Onye ndụmọdụ onyeisiala na ihe gbasara ụzọ mgbasaozi ọhụrụ bụ Bashir Ahmad deputara nke a na Twitter.,"Buhari bidoro chiwa Naijiria n'arọ 20155 Nke a ga-akwụsị arụmụka n'ebe dị icheiche ma Buhari ọ ga-azọ ọchịchị ọọ ka ọ bụ na ọ gaghị azọ. Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru na Twitter ya na Buhari kwuru ebumnobi ya n'ọụ̀bakọ ndịisi otu pati APC na-eme ugbua. End of Twitter post, 1 A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọ zuruoke." afirika-43755088,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43755088,Onye atụghị otuụzọnụzọiri ga-aga ọkụmmụọ - Adeboye,"Ukọchukwu na-ahụ maka ụlọụka akpọrọ Redeemed Christian Church of God (RCCG) na Bekee bụ Enoch Adeboye, adọọla ndị ụka ya aka na ntị maka ịkwụ ụgwọ otu ụzọ n'iri nke ndị Bekee kpọrọ ""tithing"".","Ụka Adeboye so na nke kachasị nnukwu na Naịjirịa Okwu banyere ""tithing"" bụ ihe butere ezigbote ọgbaghara n'etiti ndị ụka na ndị ụkọchukwu mgbe Maazi Freeze, bụ onye mgbasa ozi na-arụ ọrụ na Cool FM, kwuru na ndị otu Kraist ekwesịghị ịkwụ ụgwọ a makana ọ sị na ọdịghị n'akwụkwọ nsọ. Okwu a Freeze kwuru tinyere ndị ụkọchukwu na gbagharịa nke mere ka ha chọwa etu ha ga-esi kọwaara ndị otu ha na ịkwụ ""tithe"" dị mkpa. Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ha wetara ikike ha ji na-ana ""tithe"" n'akwụkwọ nsọ, mana Freeze gwara BBC na ọ bụ n'akwụkwọ nsọ agba ochie, ma kọwaa na Kraịst akwadoghị ịkwụ ụtụ a. Mana ugbua, okwu a Adeboye kwuru n'emume ndị Redeemed na-eme kwa afọ nke ha kpọrọ ""Holy Ghost Service"" ga-akpalite ọgbaghara a ọzọ. Okwuru ka ndị ka na-aghọtaghịe ""tithe"" gee ya ntị ma nụrụ ihe o kwuru. Ọ gakwara n'ihu gwa ndị ụkọchukwu ya ka ha nye ndị ha na-edu ndụmọdụ maka ọdachị ga-eso ha ma ha akwụghị ""tithe"". ""A na m enye unu ncha ohere ichegharị n'abalị a, ma laghachị ozugbo emechara nzukọ a gaa gozi ndị unu na-edu nchegharị a,"" Adeboye gwara ndị ụkọchukwu ya. Adeboye kwukwara sị ka ha gwa ndị ụka ha na onye anaghị akwụ ụtụ isi nke ụka agaghị eso ndị ga-aga elu igwe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-47732783,https://www.bbc.com/igbo/media-47732783,Election: Fayemi ka kwụ chịm n'Ekiti steeti,Ụlọikpe mkpegharị n'Abuja akwụnyela na azụ Fayemi site n'ikpe ha nyere.,"Ha kwuru na ọ ka bụ Gọvanọ agbanyeghị na Olusola Eleka nke PDP so ya zọ ọkwa kpụpụrụ ya ụlọikpe maka mpụtara ntụliaka ahụ. Cheta na Fayemi zọrọ ọkwa n'okpuru otu APC meriri ntuliaka e mere n'afọ 2018 n'Ekiti steeti. Yemi Osinbajo kpụ PDP n'ọnụ ọzọ Osinbajo jiri ụgbọala la. Osote Onyeisiala Naijirịa na-ata gọọmentị oge gara aga ụta ịmefu ego mgbe Naịjirịa kachasị akapata ego Mana ndị mmadụ na soshal midia agwaala ha hapụ ịta onye ọzọ ụta ma bido ịrụ ọrụ nwulite obodo chere ha n'ihu. Harry Kane eritela MBE Harry Kane onye ndu otu egwu boolụ mba England eritela ugo nke MBE nke pụtara Member of the order of the British Empire O ritere ya maka mbọ ọ na-agba n'ihe gbasara bọọlụ na mba ha. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lucas eriwela Lucas Hernandez dị afọ 23 Ndị otu egwu bọọlụ Bayern Munich azụọla Lucas Hernandez nke Atletico Madrid ọkpụrụkpụ ego mara abụba. Bayern goro Lucas nde paunds iri isii na asatọ maka ịgbara ha bọọlụ afọ ise. Lucas so mba France bute iko mba ụwa n'afọ 2018. Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka Mmenju ntuliaka ndị Adamawa Steeti na ugbua n'okpuruọchịchị 14 dị na steeti ahụ. Kasim Gaidam bụ Onyeisi Inec n'steeti ahụ sị na Inec kere aju n'ume na kwado ya bụ ntuliaka ebe ha chị ndị ọrụ ruru 358. Ebe a na-eme ntuliaka gunyere okpuruọchịọchị Yola South, Fufore, Ganye, Girei, Guyuk, Hong, Lamurde, Numan, Madagali, Michika, Mubi North, Shelleng, Song nakwa Toungo. Onye ọrụ Presiding Officer ndị Inec gwara ndị nta akụkọ okwu sị na ihe niile na-aga werewere dịka ntuliaka malitere na elekere asatọọ nke ụtụtụ Tọzde. Ndị ọzọ ajụla mpụtara ntuliaka onyeisiala Otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị atọ ọzọ ewepụla mpụtara ntuliaka onyeisiala 2019 ụlọikpe na arịọ ka akagbuo ya bụ mpụtara. Pati ndị a bụ Hope Democratic Party, Peoples Democratic Movement, Coalition For Change. Ngagharịiwe na Port Harcourt Otu jikọrọ ndọrọndọrọ a kpọro Inter-Party Advisory Council eburula ngaghariị iwe bugbara ndị si ọrụ nchekwa na Port Harcourt. Ha na- arịọ Inec ka ha gụchapụ mpụtar ntuliaka e mere bụ nke a chabiri n'ike maka nrụrụaka ha sị na e mere na ya. Gee Nkeji n'Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo. Akụkọ ga-amasị gị" 44654359,https://www.bbc.com/igbo/44654359,Ị ma ihe mmanụ agbịdị merela n'ala Ogoni? Lee ahụhụ ndị mmadụ na-ata,"Oge mmanụ na-apụta n'ime ala na Bomu gbawara maka ngwa ọrụ na-adịghị arụ ọrụ nke ọma n'ime okpuru ọchịchị Gokana nke Rivas steeti, ọkụ ji oge karị otu ọnwa nwe gbaa.","Ọtụtụ obodo dị na mpaghara ndịda ala Naịjirịa dịka nke a dị na Goi n'ime Ogoni na-ata ahụhụ maka mmanụ kwafuru n'ala ha Ọ ka o mesiri ka ndị ụlọọrụ Shell biara ka ha menyụọ yabụ ọkụ na kwa hichaa ebe a mmanụ kwafuru. Afọ iri agafeela kemgbe ha hichara ebe a, mana mmanụ agbịdị ka na-ehi n'ala ahụ. Onye ntaakụkọ BBC Pidgin bụ Karina Igonikon gara ileta ebe a, we hụkwa na akwụkwọ ndụ anaghị enwe ike ito n'ala ahụ nakwa ebe niile a na-esi mmanụ agbịdị. Onye chiburu dịka onyeisi ndị otu kpọrọ onwe ha 'Survival of Ogoni People (MOSOP) na Bekee bụ Ledum Mitee gwara onye ntaakụkọ BBC Pidgin na oge mberede a mere n'afọ 2008, ndị ọrụ Shell jiri aja e si ebe ọzọ kpota we kpuchie ebe a. Mana ka ntịtị oge gafere, mmanụ a bidoro na-ehi. O kwuru na, ""Oge mmanụ a kwafuru n'afọ 2009, ọ banyere n'osimiri, n'ebe dị ka Kidaro na K-Dere, mmanụ mebiri ebe azụ biri na kwa gbuo osisi puru na mmiri."" ""Ndị mmadụ anaghị enwe ike igbu azụ na mmiri ọ bụ sọọsọ mmanụ agbidi ka ị ga-ahụ"" Ishi ngwaọrụ Shell eji adọpụta mana n'ala BBC Pidgin gbara Shell ajụjụ ọnụ maka okwu a, mana ọnụ na-ekwuchitere Shell bụ Joseph Obari kwuru na ha ahụbeghị akụkọ ọbụla gosiri na mmanụ agbịdị na-ehi n'ụmị 27/52 n'afọ 2008. O kwukwara na ndị Shell rụrụ ọrụ ndozi na-ebe a maka mmanụ hiri n'afọ 2009 na 2010, na kwa na ngalaba akpọrọ National Oil Spill Detection and Response Agency NODSRA enyochaala ebe a na kwa ebe a enweghị nsogbu ọbụla. O kwuru na mmanụ hiri na Bodo abanyeghị na oshimiri nke Kidaro. Obodo a gwuru olulu a maka ị kwụsị ebe a mmanụ a na-ehi Ledum Mitee kwuru na okwu ndị Shell na-ekwu maka idozi ala bụ asị maka na onweghị ihe di n'ala gosiri na ha na-eche echiche ala ahụ. Mitee kwuru na ndị na-egbu azu na K-Dere ekpeela Shell n'ụlọikpe kemgbe afọ 2009 oge mmanụ a hiri na Bido mana ala ahụ enwegbeghị mmeri ọbụla n'ikpe a. O kwuru na n'ime akụkọ ngalaba kporọ onwe ha 'United Nations Environment Programme'(UNEP) dere ha kwuru na onye ọbụla egwula mmiri ahụ maọbụ gbuo azụ na mmiri ahụ. O kwukwara na maka ihe a mere mmiri ha, ndụ ha abụghị ka ọ sị dị ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46025130,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46025130,Abia State emegheela ụzọ maka ndị chọrọ ịchụ nta ego - Kọmịshọna mgbasaozi,Ozi na-eru BBC ntị ekwuola na Gọvanọ Abia steeti bụ Victor Okezie Ikpeazu etinyela aka n'akwụkwọ nke ga-enye ndị chọrọ ịmepe ụlọọrụ maọbụ ụlọahịa ikike ịme otu a na-efu.,"Onye ọrụaka n'Aba Ndị ga-erite uru na ihe nrite a bụ ndị ịchọrọ imepe ahịa maọbụ ụlọọrụ ọhụrụ nke enweghị ego ha ga- e ji gbata akwụkwọ ikeki a na ụlọọrụ Corporate affaires Commission (CAC). Ị debe aha n'akwụkwọ maka ihe nrite a malitere ụnyaahụ bụ 29-10-18. Ndi otu a ga e ji ọsọ na ie gawa na Ministri na ahụ maka obere ụlọọrụ na sote ya akpọrọ Ministri of Ministry of Small and Medium Enterprises Development, Investment House Umuahia. Ebe ọzọ ha nwere ike ị ga bụ Aba Chamber of Commerce, Off Aba Owerri Road, Near UBA, Aba maọbụ LEPMASS OFFICE No. 206 Faulks Road by Samek Junction, Aba. Na nkata anyị na John Okeiyi bụ Kọmishiona mgbasa ozi dị n'aka n""Abịa steeti sị enwe m aka a bụ maka ""ịkwado ndị ọrụaka kacha pee nta nakwa ndị na-etolite etolite akpọrọ MSME na aha ịchafụ na Bekee"". Gee Okeiyi ntị n'olu Abia State emegheela ụzọ maka ndị chọrọ ịchụ nta ego Okeiyi kwuru na ihe a jị dị oke mkpa bụ maka na-achọpụtara na enweghị akwụkwọ ikike a ""na adọhachị ndị ọrụaka aka azụ maka ịnata enyemaka n'aka maọbụ ego mgbazite n'aka ndị gọmentị maọbụ ụlọakụ"". Ọ sịkwa na ndị ọrụaka ruru nari ise bụ ụzọ pụta ga-erite ihe nrita. Mana enwekwara ike ịmekwa ka ndị karịri ọnụ ọgụ a ritekwa uru a ma ha gosi mmasi. Nke a bụkwa maka ikwado ndị ọrụaka n'Abia steeti. Akụkọ ga-amasi gi" 57154335,https://www.bbc.com/igbo/57154335,Ijeoma Ogwuegbu: Enwere m ọria 'Fibromyalgia' mana ụfụ ya egbochighi m ise ihe mara mma,Ijeoma Ogwuegbu bụ nwaada Igbo ji aka ya esepụta ihe bụ ọgbaraigbogharịị.,Ọ na-eme nke a n'agbanyeghị na ọ na-arịa ọrịa bekee kpọrọ 'Fibromyalgia'. Ọrịa bụ ọrịa na-egbujisi mmadụ akwara nakwa njikọ ọkpụkpụ ya niile. Nke a pụtara na Ijeoma Ogwuegbu na-anọ na nnukwu ahụ ụfụ oge niile. Mana ahụ ụfụ a egbochighi ya iji akaraka Chukwu nyere ya emepụta ihe ọma. Gere akụkọ ya n'uju. Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Vining Ogu. media-45098812,https://www.bbc.com/igbo/media-45098812,Joseph Blankson nwụrụ ka ọ zọpụtachara mmadụ 13 mmiri na-eri,Mmiri riri Joseph Blankson ka ọ zọchara mmadụ 13 oge ụgbọmmiri bu mmadụ 24 na-aga njem na Bakana dị n'okpuru ọchịchị Degema nke Rivas steeti kpuru.,"Akụkọ kwuru na ọdachi a mere oge Blankson, onye dị afọ 36, ma marakwa egwu mmiri ọfụma, tụnyere isi ya n'ihi ike ọgwụgwụ ka ọ mabara mmiri ịzọpụta onye nke iri na anọ. N'akwụkwọ ozi nke gọọmentị Rivas steeeti wepụtara nke Kọmishọna mgbasaozi bụ Emma Okah binyere aka, gọọmentị tụrụ arịrị na ọ dịghị ndụ were rite erere dị n'aja Blankson onye hapụrụ nwunye ya na ụmụ abụọ chụrụ iji zọpụta ndị ọzọ. Okah sị,"" Ike a pụrụ iche Blankson kpara bụ ihe nkuzi nye ndị dị ndụ na ọbụghị afọ ole mmadụ biri n'ụwa, kama ọ bụ ihe onye mere ka a ga-eji cheta ya."" Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-eto dịmkpa a nwụrụ n'ọgbọ ọgụ maka inye ndụ ya ka ndị ọzọ were dị ndụ. N'okwu ya n'igwe okwu Twitter, onye bụbu Osote onyeisiala Naijiria bụ Atiku Abubakar, na-ekwu na ọnwụ nwaamadị a na-echetara ndị Naijiria na ndụ ndị naijiria niile dị mkpa. End of Twitter post, 1 Ụfọdụ na-akpọ oku ka gọọmenti malite inyere ndị ezinaụlọ ọ hapụrụ aka, ebe ụfọdụ na-ekwu ka e nye ya nturuugo ala Naijiria. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42869532,https://www.bbc.com/igbo/42869532,Amerịka ebuliela mmachi ha machiri ndị gbara ọsọndụ,Ndị ọrụ gọọmentị mba Amerịka na-ekwu na ha ebuliela mmachi ha machiri ndị gbara ọsọndụ na-esi mba iri na otu abata obodo ha.,"Donald Trump tinyere mmachi a n'ọnwa Oktoba 2017. Mana, onye ode akwụkwọ ndị Homeland Security na Amerịka bụ Kirstjen Nielsen sị na ndị si mba ndị a ka ga-agabiga ule 'ihe ize ndụ' (risk-assessment) nke ga-egosi ma ha enwere ike ịkpa ike ma ha bata Amerịka, tupu enye ha ohere ịbata. Ọchịchị Donald Trump tinyere mmachi a metụtara mba iri ndị na-ekpe alakụba na mba North Korea, n'ọnwa Oktoba 2017. Nwaada Nielsen kwuru sị ""ọ dị anyị mkpa ịmata onye na-abata"". Onye ode akwụkwọ ndị Homeland Security na Amerịka bụ Kirstjen Nielsen ekwuputala na ndị gbara ọsọndụ ga-ele ule ""ihe ize ndụ"" ""Ihe mgbakwunye nchekwa ndị a ga-eme ka ọ ghara ịdịrị ndị ọjọọ mfe imebicha atụmatụ ndị gbara ọsọ ndụ anyị nwere, ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike si ụzọ ihe ize ndụ ndị ọzọ chekwaa obodo anyị."" Obodo ndị ọ metụtara: N'agbanyeghi na-akpọbeghị obodo ndị a aha, otu ndị gbara ọsọ ndụ kwuru sị na mmachi a metụtara obodo ndị dịka Egypt, Iran, Iraq, Libya, Mali, North Korea, Somalia, South Sudan, Sudan, Syria na Yemen. N'ime afọ atọ garaaga, ihe ruru ndị pasentị iri anọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ batara mba Amerịka si n'obodo iri na otu a. Ka Trump manyechara iwu mmachi a n'ọnwa Oktoba, ọnụọgụgụ ndị a gbara ọsọ ndụ gbabata Amerịka kebiri ekebi site na puku iri anọ na ise (45,000) ruo iri abụọ na atọ (23), dịka Reuters siri kwuo." afirika-49625075,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49625075,Bianca Andreescu: Nwa dị afọ 19 anarala Serena Williams ụra rahụ,Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu akpọrọ Bianca Andreescu anarala Serena Williams ụra rahụ site n'ịmabụrụ iko US Open nke 2019.,"Williams adaala na agba ikpeazụ asọmpị anọ Mmeri a napụrụ Williams ohere ọ kara iji mabuo iko 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya. Iko a bụ 'Grand Slam' nke mbụ Andreescu bụ onye Canada mabuterela kamgbe ọ malitere ịkụ bọọlụ Tenisi. Nke a bụ mbụ Andreescu na-amabute iko 'Grand Slam' Williams onye dị afọ iri atọ na asaa emenwụghị ọtụtụ ihe Andreescu onye ọbara ya ka na-apụ ọkụ mere n'asọmpị ahụ. ""Afọ a abụrụla nrọ bịara na mmezu,"" bụ okwu pụrụ n'ọnụ Andreescu mgbe o merichara. Andreescu onye gosiri obi ụtọ ya nke ukwu kwuru na ọ bụrụ ya nnukwu mbụlịelu na ya na Serena Williams sọkọtara mpi na US Open nke afọ 2019. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46100150,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46100150,"NYSC Allowance: Gịnị ka ị ga-ejinwu N19,800 mee?","Gịnị ka ị ga-ejinwu N19,800 bụ ego 'allowee' a na-akwụ ndị na-efe ala nna otu afọ mee?","#NYSCAllowance malitere iwu na soshal midia ka ndị mmadụ, ọkachasị ndị ferela ala nna ha n'oge gara aga, ji ya na-eme ihe ọchị. Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ego ahụ pere oke mpe ịkwụ ndị mmadụ. Mana BBC Igbo chọrọ igosi gị uru ole na ole ego a nwere ike ịbara gị. Uru 19,800 bara 1) Ị ga-ejinwu ya zụta ihe Bekee kpọro 'data', ma were ya bụ data na-ere ahịa n'elu soshal midia. 2) Ị ga-ejinwu ya bido ahịa ọkịrịka, ebe ọ ga-abụ ị zụta akwa e yiri eyi n'ọnụ ala, i tinyetụ ya ego ma regaharịa ya. 3) Ị ga-ejinwu ya bido ahịa ngwa ekwentị dị icheiche. 4) Ị ga-ejinwukwa ya kpọrọ ndị enyi gị maọbụ ezinaụlọ gị taa nkwọbi na isi ewu ma were ezigbote mmanya ngwọ butuo ya. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ego alawi @Rouvafe kwuru na ego alawi ga-ezu ịzụta naanị ji abụọ nakwa obere ihe ndị ọzọ. @Stkeypoint kwuru na ị kwụ onye na-efe ala nna ya N19,800 dị ka ịchọrọ onye arịrịọ obere ego. @degosTee na-ajụ etu N19,800 ga-esi ezuru ndị mmadụ igbo mkpa ha n'otu ọnwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị" 46337009,https://www.bbc.com/igbo/46337009,Ipob: Ndị uweojii asaala ndị na-ebo ha ebubo aghụghọ,Ndị uweojii Anambara steeti akwala ndị mmadụ ka ha wetara ha ozi ndị Ipob kpara mkpamkpa na Nnewi ụbọchị Fraide gara aga.,"Ndị uweojii nọ n'Anambara kwuru na ndị otu IPOB ji mma merụọ ndị otu ha ahụ Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nwere n'ekwenti o kwuru na ndị na-ekwu na ọ bụghị ndị mere ihe ka ndị uweojii nwụchịị gosiri na ha mara ndị mere ihe ndị ahụ n'ezie. """"Ị sị na ọbụghị ndị mere ihe ka a nwụchiri, nke a pụtara na ị ma ndị mere ya n'ezie., ya bụ pụta bịa gwa ndị uweojii ndị mere ya n'ezie."" Cheta na isi ụlọ ọrụ ndị uweojii n'Abuja wepụtara aha mmadụ 33 bụ ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị Ipob mere ngagharịiwe ebe ha gburu otu onye uweojii, ma merụkwa onyeisi ndị uweojii ahụ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ. N'akwụkwọ mgbasaozi nke ha wepụtara n'ụtụtụ Monde, Nọvemba 26, ndị uweojii kwuru na otu Ipob bụ otu a mabidoro n'iwu dịka otu ndị na-eyi ndụ egwu nke a kpọrọ ""Terrorist Group"" na Bekee. Ha kwukwara na ndị Ipob merụrụ ""onyeisi ndị uweojii(DPO) ogige Central Police Station (CPS), Nnewi bụ CSP Babalola Adewunyi, ASP Micheal Duru nke 'Area Command, Nnewi' nakwa Inspector Akinbami Olaniyi nke CPS Nnewi ahụ. ""E bugara ndị uweojii ahụ merụrụ ahụ ụlọọgwụ maka nleta mana Inspektọ mechara nwụọ ebe dị ogbo ya ka na-anata nleta n'ụlọọgwụ."" Ndi uweojii kwuru na ha nwetara ọgbatumtum asatọ, ọkọlọtọ Ipob ise nakwa okpu Ipob ise dịka ihe akaebe. Ha boro ndị Ipob ebubo iji ngwaọgụ dị egwu gbakọọ na nsonso ụlọọgwụ nkuzi dị n'ụzọ Owere, iji bute ọgbaghara. Ha kwuru na ngwa ngwa ndị uweojii ji bịa gbara mbọ iji gbochie ha ibute ọgbaghara, ebe ha gburu otu onye otu ha, merụọ abụọ ahụ ma sunye ụgbọala ha ọkụ. Ndị uweojii bokwara otu Ipob ebubo ịnapụ ha egbe ike nke a kpọrọ AK-47 nakwa nke obere a kpọrọ ""Beretta"" na mgbọegbe. Ha kwuru na ndị Ipob jiri mma na ngwaọgụ ndị ọzọ wee wakpokwa ndị mmadụ, na-eti ""No Election without Referedum"". Lee aha ndị ha wepụtara: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43198960,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43198960,World Malaria Day: Ihe ise ịba jiri dị iche na Taịfọd,Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-arịa ọrịa taifọd na-eche na ha na-arịa ịba n'ihi mgbagwoju anya dị n'ọrịa abụọ ndị a.,"Anwụnta na-ebute ọrịa ịba Ịba nke Bekee kpọrọ 'malaria' bụ ọrịa a na-ebute ma akwụnta tanye mmadụ nje bu ọrịa n'ahụ, ebe taifọd bụ ọrịa a na-ebute site nje a kpọrọ, 'Salmonella Typhi' nke na-aṅụta na mmiri adịghị ọcha maọbụ nri mebiri emebi. Ịba na Taifod bụ ọrịa abụọ a na-arịakarị na mpaghara Afrịka. Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka. n'aka nke ọzọ, ngụkọ nke WHO mere n'afọ 2019 na-ekwu na mmadu ruru agbata nde iri na otu na iri abụọ na-arịa taifọd kwa afọ. Taifọd na-ebutekwa ọnwụ mmadụ ruru agbata puku,otu nari na iri abụọ na asatọ(128,000) na putu otu nari iri isii na otu(161,000). BBC gbara ọkachamara ahụike bụ Dkta Ikechukwu Okoroafor nke ụlọọgwụ, Mount Sinai Hospital, Lagos, ajụjụọnụ banyere ihe dị iche n'etiti ọrịa ịba na taifọd. Anwụnta bere n'ụlọmgbochi anwụnta Njirimara ịba na taifọd Nke a bụ ihe Dkta Ikechukwu Okoroafor kwuru maka ọrịa ọjọọ abụọ a: Gee ihe ise iba jiri dị iche na Taịfọd n'ọnụ Dr Ikechukwu Okoroafor: Ihe ise iba jiri dị iche na taịfọd Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51665154,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665154,Coronavirus in Nigeria: Lee azịza ajụjụ ndị na-anụ gị ọkụ n'obi,"Akụkọ maka ọrịa Coronavirus ịbata na Naịjirịa abụghịzị akụkọ ọhụrụ, mana mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa ekwuola ka obi ghara ịmapụ onye ọbụla.","Dịka ọrịa a na-efesa n'akụkụ ụwa niile, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ ọrị na-agbasa n'ikuku, nke Bekee kpọrọ 'airborne disease'. Mana nke a abụchaghị eziokwu. Lee azịza niile otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) nyere gbasara ọrịa coronavirus. Gịnị bụ coronavirus maọbụ COVID-19? Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa nke gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ. Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Severe Acute Respiratory Syndrome bụ SARS n'ịchafụ (nke si na buusu malite) nakwa Middle East Respiratory Syndrome bụ MERS n'ịchafụ (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite. COVID-19 bụ aha a gụrụ ọrịa coronavirus ọhụrụ nke si n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna malite n'ọnwa Disemba 2019. Kedụ etu COVID-19 si agbasa? Imetụ nje coronavirus aka na-amaghị ama, ma were aka ahụ hie n'anya gị, maọbụ metụ n'imi maọbụ ntị gị, ọrịa ahụ ga-efe gị Ị nwere ike ibute ọrịa a site n'aka onye bu ya. Ọ bụrụ na onye bu ọrịa a maa uzere maọbụ kwaa ụkwara, nje ahụ nwere ike ịdakwasị n'elu ihe ụfọdụ. Onye ọzọ metụ ihe ndị ahụ nje dakwasara aka ma tinyekwa aka ahụ n'anya, n'ọnụ maọbụ n'imi ya, nje ahụ efeela ya. data n'uju *Mmadụ ole nwụru kwa otu puku Biko kwalite browsa gị n'iji hụ ihe niile Maapụ a na-egosi ọnụọgụ nke ndị Mahadum Johns Hopkins na-edepụta kwa mgbe kwa mgbe, onwereike ghara igosicha ka ihe siri kwuru ugbua na mba ụfọdụ. **Ozi ikpeazụ ndị ọhụrụ bu ọrịa a bụ ngụkọ nke ụbọchị atọ. N'ihi ntụgharị n'ọgụọgụgụ ndị bu ya, ọ gaghị adị mfe ịgbakọ nke ụbọchị a. Ebee o si: Mahadum Johns Hopkins, ndị isi mba ahụike na mba Mgbe edere akara: 4 Disemba 2020, 10:27 GMT+1 Olu onye Naịjirịa nọ na China na-ekwu maka ihe ha na-agabiga n'ihi Coronavirus Mmadụ nwekwara ike ikute ọrịa a n'ume ma ọ bụrụ na o kuru ume onye bu ọrịa a mapụtara n'uzere maọbụ kwapụtara n'ụkwara. Ya mere, ọ dị mkpa ka ị nọtee onye ọbụla na-arịa ọrịa aka ihe ruru nzọụkwụ atọ ma ị kwụrụ n'akụkụ ya. Otu WHO ka na-emekwa nnyocha iji chọpụta ma o nwere ụzọ ọzọ ọrịa a si agbasa na-abụghị ụzọ ndị e depụtara ebe a. Kedụ ihe ga-agba ama na mmadụ bu ọrịa a? Ihe ndị kacha agba ama ọrịa a bụ ahụọkụ, ike ọgwụgwụ nakwa ụkwara nta. Dịka WHO si kwuo, ụfọdụ ndị mmadụ na-enwekwa ahụ mgbu, azụzụ, ọnya akpịrị nakwa afọ ọsịsa, ụfọdụ bụkwa ndị ọ na-ara ahụ iku ume. Ha kwukwara na ọ bụghị mmadụ niile bu ọrịa a na-egosiputa ihe mgbaama niile a, ebe ọ na-abụghị mmadụ niile na-anata ọgwụgwọ tupu ha agbakee. Ha kwuru na ọrịa a kacha emekpa ndị agadị nakwa ndị nwere ọrịa dịka ọbara mgbalielu, ọrịa obi maọbụ ọrịa shuga, ahụ. Kedụ etu m ga-esi echekwa onwe m ma gbochie mfesa ọrịa a? Were ncha na-akwọ aka gị oge niile Gbado anya n'ihe ekwe na-akụ gbasara ọnọdụ ọrịa a site n'ọbaozi ndị kwesịrị ntụkwasị obi maka ntaakụkọ. Ndị dịka WHO, mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjiria nakwa mịnịstrị ahụike nke ebe i bi. Ihe ndị ọzọ ị ga-emenwu gụnyere: Were nkwọcha aka pụrụ iche a kpọrọ 'hand sanitizer' na-edebe aka gị ọcha Na gburugburu mbaụwa niile, ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị asatọ. Ihe ruru mmadụ puku iri asatọ bukwa ya bụ ọrịa ugbua. Mana oziọma dị na ya bụ na ihe ruru mmadụ puku iri atọ esila na ya bụ gbakee. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọchịchị Jonathan chiri 'insecurity' Igwe na Naịjirịa - Mbaka" afirika-48701338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48701338,Super Falcons agafeela agba nke abụọ ka Thailand tunyere ha azụ,"Super Falcons nke Naịjirịa ga-ezute otu egwueregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Jamanị n'obodo Grenoble ụbọchị Satọde n'agba nke abụọ asọmpị Bekee kpọrọ 2019 ""Women's World Cup"".","Ndi nkwado otu egwu bọọlụ ụmụnwanyị Naijiria na-enwe aṅụrị Super Falcons tozuru iso n'agba nke abụọ ka Chile ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Thailand, nke nyere ya ohere ịbanye ụgbọ dịka ha turu ugo ọkamma na ndị ikpeazu. Ọ bụ na Monde bụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Juun ka Falcons sụrụ mpị nke ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa na-asị na VAR napụrụ ha mana omere abalị atọ iji chọpụta ka ha a ga-etuozu ịga agba nke abụọ. Dịka agbachaala asọmpi niile dị n'agba nke mbụ, Falcons pụtara dịka nke kachasị mee ọfụma na ndị achịtaghị aja nke ga-enye ohere itozu gaa agba nke abụọ. Ọ bụ otu egwuregwu atọ na-agafe dịka nke ka mma na ndị ikpeazụ. Kameroon bụ mba ọzọ n'Afịrịka ritere uru a ụnyaahụ. Dịka ha mere ụfọma n'asọmpị ha na Frans, ọtụtụ ndị na-akwado ha nwere olilanya na ha ga-agba mbọ na agna nke abụọ a. Gọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa." afirika-54906705,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54906705,Igbo Culture: Omenala iri ndị Igbo na nke ndị Juu jiri yie onwe ha,Nkwenye ụfọdụ ndị Igbo bụ na Igbo si na mba Izrel bịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bịa biri.,"Ndí Juu na ndí Igbo na-ekpe okpukpere Juu Ndi nwere nkwenye a na-ekwu na Igbo so na ụmụ Gad, nwa Jacob n'Akwụkwọ Nso, onye hapụrụ ala nna ya bia n' Ọdịda Anyanwụ Afrịka n'ebe a kpọrọ Nri mere ebe obibi ma nọrọ ebe ahụ mụbaa. N'aka nke ọzọ, ụfọdụ dịka Ọkammụta Catherine Achọlonu(lara mụọ) na-ekwusi ike na ọ bụ ndị Juu bụ ndị si na mpaghara Ọwụwa Naijiria hapụ oge gboo ha biri n'ala Izrel. Dịka ndọrịtaụka na-aga n'ihi na-enweghị onye kwetara nke ibe ya, otu ihe doro anya ndị otu abụọ a nwere nkwenye na ya bụ na ndị Igbo na ndị Juu si n'otu afọ nne. Lee ihe ụfọdụ ha ji kwenye na nke a : 1. Ibi Ugwu Dịka ndị Igbo si ebi nwa nwoke ugwu n'abalị asatọ. Ndị Juu na-ebikwa nwa ha ugwu ma o ruo abalị asatọ e jiri mụọ ya dịka ọ dị n'akwụkwọ 'Genesis' 17:10-14. 2. Ịchụ aja Ndị Igbo nwere nkwenye n'ịchụ aja iji rịọ Chineke na ndị ochie arịrịọ. Ndị Juu nwekwara omenala ahụ dịka ha na-eji anụmanụ na ihe ndị e wetara n'ubi achụrụ Chukwu aja dịka ọ dị na akwụkwọ Ọpụpụ 29:40-41. Onye nkuzi okpukperechi ndị Juu bụ Solomon Madụka kọwara na ihe mere na ndị okpukpere Juu anaghị achụzị aja anụmanụ bụ n'ihi na e bibiela 'Temple' bụ ebe Chineke nyere n'iwu bụ ebe ịchụ aja. 3. Emume agbamakwụkwọ Agbụrụ abụọ ndị a na-eji mmanya eme alụm nwaanyị. Ndị Igbo na-eji nkwụọcha eme emume alụm nwaanyị nke ha, ebe ndị Juu na-eji mmanya vine eme nke ha. Cheta oriri agbakwụkwọ E mere n'ala Kana dị na Galilee, ebe mmanya gwụnarịrị ndị na-agba akwụkwọ nke mere ka Nne Kraistị gakwuru nwa ya rịọ ya o nyere ndị ahụ aka ka ihere ghara ime ha dịka o siri dị n'akwụkwọ Johnụ 2:1-12. 4. Nkwenye n'otu Chukwu Ndị Juu kwenyere n'otu Chukwu, Ọkaka bi n'Igwe, nke ha na-akpọ ""Chukwu Okike Abiama"". Ndị Igbo nwere otu nkwenye n'otu Chineke na agbanyeghị na o nwere obere chi ndị hana-efe si na ha er Na nkọwa, Solomon Madụka, "" Ihe mere o jiri dịka ndị Igbo nwere nkwenye na chi ndị ọzọ bụ mmekọrịta ha na ndị ọzọ. ""Dịka ndị Juu si site na mmekọrịta ha na ndị ọzọ fewe chị ndị ọzọ, ndị Igbo si na mmetọ fewe chị dị ọzọ mana ịnyọcha ya ọfụma n'oge gbọọ nnanị otu Chi Ukwu ka Igbo nwere"" 5. Nsọ nwaanyị Dịka omenala ndị Juu siri dị, nwaanyị nọ na nso ya na-edopu onwe ya iche, abalị asaa. Dịka Akwụkwọ Nso si kọwaaa ya n'akwụkwọ Leviticus 15:19-30 , nwoke ọbụla metụrụ ya ahụ ga-edopụkwa onye ya iche abalị asaa. Etu o ka ọ dị n'omenala Igbo, Nwaanyị nọ na nsọ na-apụrụ onwe ya iche, ọ gaghị na-esiri di ya nri nke ya na di ya na-anọkọ dịka di na nwunye ganye ma o nọcha na nso ya. Udị nso ahụ adịghịkwa ugbua. Naanị ndị dibịa na ụfọdụ ụmụnwoke chiri ụfọdụ echiche ka na-asọ nwaanyị nọ na nsọ. 6. Ịbanye otu ọgbọ N'Omenala ndị Juu, nwoke toruo afọ iri na atọ, e mere ya emume 7. Ọnwa ọhụrụ Ọnwa ọhụrụ bụ ihe ndị Igbo na ndị Juu ejighị ekwu egwu ma ọlị. Ka na-anụrị ma gọọ ọfọ ndụ nakwa ihe ọma ndị ọzọ dịka ọ dị n'akwụkwọ Ọnụọgụgụ (Numbers) 10:10. 8. Ha anaghị enwe eze Igbo enwe eze, Igbo enwe eze bụ okwu e ji akọwa na inwe eze adịghị na ntọnala ndị Igbo. Mana ị ma na ndị Juu anaghị enwe eze? Dịka Solomon Maduka siri kọwaa ""ha ekweghị na inwe eze. Ha kwenyere na ọ bụ Chukwu bụ Eze"". I lee anya n' Akwụkwọ Nsọ,( 1Samuel 8:4-21), Chukwu were iwe oge ụmụ Izrel rịọrọ Ya ka o nye ha eze ma kwuo na o gosiri na ha ajụla Ya. 9. Asụsụ Dịka Maduka siri kọwaa, ụfọdụ okwu Igbo nwre oyoiri n'asụsụ ndị Juu. Ọmụmaatụ: Okwu - koku Ọnụụzọ(doorpost)- mezuzah. 10. Okeala Dịka ndị Igbo ejighị oke ala achị, Ndị Juu ejighịkwa ya egwu egwu. Akwụkwọ Deuteronomy 19:14 dọrọ ha aka na ntị ka mmadụ ghara iwegharị okeala onye agbata obi ha. 11. Akwamozu Ndị Igbo na-akwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu pụrụ iche ma na-enyekwa ndị mmadụ nwụnarịrị nkwado site na ịnọnyere ha nakwa iti ha aka n'obi. Ndị Juu na-eme kwa otu ahụ dịka Debra Darvick siri kọwapụta na websaitị ya. Ha na-asa ozu ahụ ma yinyekwa ya akwa ọcha ma tinye ya n'igbe ozu." 42917641,https://www.bbc.com/igbo/42917641,Ebutela Okpunnabụenyi ruru otu narị na iri n'olimpik,"Ndị na-akwado olimpiks nke oge oyi 2018 na Pyeongchang, a na-atụ anya inwe ịgba n'ezi nke kachasị nke ntị nụ goro?","Obodo PyeongChang na-anabata ndị na-eme egwuregwu (athletes) olimpik nke 2018 Egwuregwu olimpiks ga-ebido n'izuụka n'abia mana ndị na-akwado ya bụ ndị Saut Koria ebuterela ndi na-eme olimpik okpunnabụenyi ruru puku otu nari na iri. Okpunnabụenyi ndị a ebutere, ji puku iri karịa nke ebutere ndị so mee egwuregwu olimpik garaaga na Sọchi dị na Rọshia. N'agbanyeghi na onwere ihe ndị ọzọ na-amasị ndị egwuregwu a dịka ebe a na-eme ihe nkiri, ebe a na-ekpe ekpere na ebe ndị a na-eme njike maka egwuregwu, a na-atụ anya na ha ga-agba n'ezi ọfụma. A ga-enyekwa ha ihe ndị dị icheiche mmadụ ji enwete onwe ya n'ụlọ nke ya, nke ga-adị n'ebe a na-akpọ 'athlete's village' dị n'ime 'olympic village'. Ndị ọzọ ọ ga-emetụta Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-eme okpunnabụenyi a bụ Convenience, kwuru sị na ha ga-enyekwa ndị ntaakụkọ na ndị nkiri." afirika-55648514,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55648514,"Ndubuisi Godwin Kanu: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ndubusi Kanu bụ Gọvanọ mbụ Imo steeti,"" nwụọrọla",Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buharui atụọla ezipụlara ezinaụlọ ọchịagha mmiri bụ Rear Admiral Ndubuisi Kanu bụ onye nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde ka ọ rịchara ahụ ogologo oge.,"Otu onye dị ya nso achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na Kanu nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ya na Legọs ka ọ gbachara afọ 77. N'ozi nke onye nnyemaka ya na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara n' igwe okwu Twitter, Buhari tiri ezinaụlọ ya, ndị Legos na Imo steeti bụ ebe ọ chịrị aka n'obi maka ọnwụ ya. N'otu aka ahụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila kwuru na ihe a ga-eji echeta Kanu bụ 'uchu o tinyere n'imepe Legọs steeti na steeti ndị ọzọ ọ chịrị. Gọvanọ Imo steetị bụ Hope Uzodinma, onye kwuru na ya bụ ọnwụ dara ya na mberede sị na Kanu ji obi ya na ike ya niile gbara Naijiria odibo. Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu kwuru na ọnwụ ya bụ nnukwu ihe furu Naijiria. Ihe ndị ọzọ nwere agba na-ekwu maka Ndubusis Kanu Senetọ Shehu Sani kwuru na Kanu bụ ""odogwu nwoke nakwa otu n'ime nna ọchịchị onye kwuuche ya"". Goddy Uwazuruike bụbụ onyeisi otu Aka Ikenga kwuru na ""dịka gọvanọ Imo nakwa Legos, o gosiri ụkpụrụ tọrọ atọ....""Nnukwu mmadụ furu anyị."" Ihe ị kwesiri ịma maka Kanu" afirika-49950410,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950410,Sex for Grades: Unilag akpọchiela ụzọ Dr. Boniface Igbeneghu,Ozi si n'ọnụ ụmụakwụkwọ mahadum Unilag apụta n'ụtụtụ a bụ na otụtụ ndị nkuzi Unilag ekweghị anabata ụmụakwụkwọ ụnayahụ n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.,"Nke a na-eme dịka ụlọọrụ BBC wepụtachara ihe nkiri gosiri ka ndị nkuzi na-ememina ụfọdụ ụmụakwụkwọ na mahadum Unilag nakwa nke Ghana. Kirie ya bụ ihe nkiri n'uju ebe a ka ịhụ ndị nkuzi niile agbara n'anwụ: Mahadum Unilag kwusituru Dọkịnta Boniface Igbeneghu ma kwụsị ikwụ ya ụgwọ ọnwa. Akwukwo ozi Unilag gosiri iwe ha na etu ha si machi Igbeneghu Mahadum ahụ gakwara n'ihu mechie ebe ahụ ọ kpọpụtara dịka 'ụlọ oyi' bụ ebe ọ sị na ndị nkuzi na-apị ụmụnwaanyị aka n'ara. Ụka 'Four Square' agbarụọla ihu ma kwuo na ha kwọpụla aka n'isi Dọkịta Boniface Igbeneghu bụkwa ụkọchukwu ha. Ha kwuru na ha ahụla ihe nkiri na-egosi agwa ọjọ ọ kpara ma na-ekwu na ha ga-achọta ntaramahụhụ dị mma nye ya ma ha mecha nchọpụta ha. Ụmụakwụkwọ Unilag na-ekwu na ha ahụbeghị onye nkuzi ahụ n'ụlọakwụkwọ kamgbe ihe a mechara. Ihe ndị Ghana na-ekwu maka atụmaatụ a Ọ bụghị naanị onye nkuzi Unilag ka agbara n'anwụ n'ihe nkiri gosiri ka ndị nkuzi mahadum si edinaa ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi Ghana abụọ akpọrọ Ransford Edward Gyampo nakwa Paul Kwame Butakor na-akụzi na Mahadum Ghana sokwa. Lekwa ka ụmụakwụkwọ ya si nabata Butakor taa n'ụlọakwụkwọ ebe ọ na-akụzi. Njiji ejiwela ebe akụkọ na-akọ na soshal midia kamgbe ngalaba BBC akpọrọ 'Africa Eye' wepụtachara ihe nkiri gosiri ebe onye nkuzi Unilag na-arịọ ka o dinaa nwataakwụkwọ ya. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu katọrọ agwa a ebe ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-ekele ụlọọrụ BBC maka etu ha si mee ya bụ nchọpụta. @atiku kwuru na agwa bụ nke ekwesighị ịnabata ma na-arịọ ka ewepụta ụzọ tọrọ atọ a ga-eji kwụsị ya. Ihe ndị nkuzi Unilag kwuru maka atụmaatụ a Onye nkuzi Unilag na-achọghị ka-akpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ nụtụla ka ụmụakwụkwọ na-akọ maka ihe dị otu a. Mana o kwuru na ufọdụ oge, ọ bụ ụmụakwụkwọ na-akpata ya. Mgbe anyị jụrụ ya kedụ etu ọ bụ, o kpọpụtara ihe ndị a. O kwuru na ihe ya mere mgbe ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị gwara ya maka ndị nkuzi na-enye ha nsogbu bụ na ọ gwara ha ka gaa kpesa n'aka ngalaba na-ahụ maka itụzirị ụmụakwụkwọ ụzọ ziri ezi. O nyere ụmụakwụkwo ndụmọdụ ka ogo ọbụla ha nwetere n'ule ju ha afọ ka ndị nkuzi ghara ịji maka oke ọchịchọ na-anwa ha ọnwụnwa ndịna. Lee ụfọdụ ndị mmadụ kwuru n'elu soshal midia @DrJoeAbah toro nwata nwagbọghọ ahụ wepụtara onwe ị ga-arapụta ndị nkuzi na-eme arụrụana a. @matthewamad kwuru na ekwesiri inye nwada ahụ so BBC ga mee nchọpụta ahụ nturuugo pụrụiche. @weirdoonthebloc na-ajụ kedụ ihe bụ 'ụlọ oyi' akpọrọ aha n'akụkọ a. @UgonnaOkere1 kwuru na ọ bụ iko nwoke a juru eju. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ọka mmụta Boniface Igbenehue" afirika-48856260,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48856260,Elisha Abbo: Abike Dabiri akpaliela ndọrịtaụka maka APC na PDP,Ụmụ Naijiria eriela Abike Dabiri na ndụ maka ibuga okwu gbasara Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra n'okwu otu ndọrọndọrọ ọchịchi.,"Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuuzde gosiri ebe Senetọ Elisha Abbo mara nwaanyị ụra chara ọkụ n'ọdọahịa. N'itinye ọnụ n'okwuahụ, Abike Dabiri sịrị na ""ọ bụkwa nwoke 'PDP' a sịrị na o meriri otu n'ime ụmụnwaanyị ndị omeiwu anyị nwere ugwu bụ Senatọr Binta Masi Garba."" End of Twitter post, 1 Okwu ahụ ọ tụpụrụ kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ iwe na soshal midia ma mee ka ha bido ndọrịtaụka ndị ka mma n'etiti APC na PDP dịka o siri gbasa ileba anya n'agwa ọjọọ ndị otu pati ha kparala. Kedụ ndị ka mma na itinye anya na mmehie ndị otu ha; APC ka ọ bụ PDP? Ya bụ ndọrịtaaụka mere aha Abike Dabiri na Ganduje ji na-ewu na soshal midia dịka ndị mmadụ na-arụtụ aka agwa ọjọọ ndị nọ n'APC kparala nke ndị otu ha emeghị ihe ọbụla banyere ya nakwa ihe ndị PDP kwuru makaa onye otu ha. Ha kwuru na Abike Dabiri na ndị otu pati APC na-agbado mmehie ndị pati ha aja, ma nwere opi afụ nke ndị pati PDP. @Papadonkee, @DRmuzoic nakwa @tonyeray33 nyere ọmụmatụ gọvanọ Ganduje nke ihe onyonyo fegharịrị gosiri ebe ọ na-afọnye ego n'akpa akwa ya nakwa Omo-Agege onyee eboro ebubo izu ọfọ ụlọomeiwu. Ihe ndị PDP kwuru maka agwa Elisha Ọtụtụ ndị PDP welitere isi gụnyere Atiku Abubakar, Reno Omokri na Femi Fani Kayode katọrọ agwa Senetọ Elisha Abbo sị na ọ bụ ihe jọgburu udele, sigbuo nkapị. Ha kpọrọ oku ka ndị uweojii lebanye ya anya ma nye nwaanyị ndụmọdụ ka ọ gba Abbo akwụkwọ n'ụlọikpe. Pati PDP n'onwe ya katọkwara agwa onye otu ha kpara sị na ""o nweghị onye ṅụjuru mmiri ara afọ ga-akpa ụdị agwa ahụ."" Ha rụtụrụ aka na" 48698673,https://www.bbc.com/igbo/48698673,Lagos-Badagry: Container adapiala ụgbọala na 'Trade Fair' n'ụzọ Badagry na Legọọsi,Gwongworo e ji ebu ngwa ahịa nke a na-akpọ 'container' na bekee adaala n'akụkụ ulọahịa 'tradefair International' dị n'ụzọ Badagry na Legọs steeti.,"Ogbe ebe ihe ahụ mere bu ebe ọtụtụ ụmụ Igbo na-azọ ahịa. Content is not available End of Facebook post, 1 Dịka BBC siri nụ, onweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede nke a na-enwe onye merụrụ ahụ. Nke a abụghị mbụ ụdị ihe a na-eme na Steeti Legọs. Abalị anọ gara aga, gwongworo bu ngwa ahia dapịara ụgbọala abụọ na Tinkan Ailand nke dị na Apapa na Legọs. Otedola ereela Forte Oil, gaa ihu Otu onye ojiegochụego ama ama bụ Femi Otedola ereela ụlọrụ mmanụ ya ama dịka 'Forte Oil.' Otedola gbara ama nke n'ozi o wepụtara n'igwe okwu Instagramm ya na ya agbaghapụla ya bụ ụgbọ banye n'ọzọ ya bụ inye ọkụ latrik site n'ụlọọrụ ọ kpọrọ 'Geregu Power Plc.' Ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko 'Sickle Cell' Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko nke pụtara 'Sickle Cell' na Bekee ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ọ na-enye na-ahụ adụọla ndụmọdụ ọhụrụ. Ha kwuru na nri dịka ji, akpụ na osikapa ga-enye ndị ahụ ike ma gbado ha ume. Ha kwukwara na akwụkwọ nri na mkpụrụosisi dị icheiche bụ ụdị nri ndị na-arịa 'Sickle cell' kwesiri ị na-eri ga-edozi ahụ ha. Anambra Assembly: Ihe mere eji mee iwu alụm di na nwunye ndị 'Sickle Cell' Ụlọikpe akagbuola iwu gbasara ịgbasa ozioma Kaduna steeti gọvanọ Nasir El-Rufai Nke ọhụrụ na-eru anyị ntị ugbua bụ na otu ụlọikpe ukwu nke Kaduna steeti akagbuola iwu kwuru na onye ọbụla na-agbasa ozioma ga-anata ikike tupu o mee nke a nke ụlọomeiwu na gọọmenti steeti ahụ hiwere na nsonso. Mana Gọọmentị Kaduna ekwuola na ha na-akwado ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe. Ụmụafọ Igbo ise emerụọla ahụ na Togo Ụmụafọ Igbo ise merụrụ nnukwu ahụ na nghọtahie sogbu dapụtara n'etiti ụmụIgbo na ndị Togo na Lome, isiobodo Togo. 'Ṅụọ mmịrị tọgbọ iko n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ' Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka amanyela iwu ọhụrụ ga-enye ndị ọgba bọọlụ ohere abụọ iji ṅụ mmiri ma zuo ike n'ihi oke anwụ ọchịcha. Iwu a ga-ebido n'asọmpi AFCON nke a ga-amalite n'ụbọchị Fraide izu a." afirika-53514026,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53514026,"Nnyocha NDDC, NNPC, ụlọakụ na nrụrụaka ise kpọtụru akpọtu na Naijiria","Kemgbe izu ole na ole, ụmụ Naijiria na-ele ihe nkiri na-eme ka ihe onyonyo Nollywood dịka ụlọmeiwu na-eme nnyocha ihe mere ego dị ijeri iri anọ nagala a kpọrọ ""Niger Delta Development Commission"" (NDDC) kwesiri iji rụọ ọrụ mmepe obodo.","Bido n'ebubo nke onye bụbu onyeisi NDDC bụ Joy Nunieh boro Godwill Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta, onye ụlọọrụ NDDC dị n'okpuru ya were rue nke Akpabio boro ndị omeiwu ruo etu ndị Uweojii si wakpoo ụlọ Nunieh n'ụzọ ụtụtụ, ihe nkiri na-eme na-etipụta ụfọdụ ụmụ Naijiria akwa, ebe ọ na-atọkwa imirikiti ọchị. Mana ọ bụghị taa ka ukwu jiri dị n'azụ, nnyocha NDDC abụghị mbụ e merela nnyocha kpụ ọkụ n'ọnụ na Naijiria dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ewe ha dịka bụ ""ụja nkịta na-agbọ onye nwe ya"". Lee ụfọdụ nnyocha e mere metụtara mmefu ego, i chere na chi ga-eji ehihie jie na Naijiria mana o jighị: 1. Nnyocha ijeri dọla 16 ($16Bn)ego ọkụ latrik nke afọ 2009 Nke a bụ nnyocha ihe mere ijeri dọla iri na isii ego e tinyere na ịhazigharị oku latrik na Naijria bido n'afọ 1999 rue afọ 2007 nke Ụlọomeiwu Nta site na kọmiti ha na-ahụ maka ọkụ latrik. Tupu nnyocha ahụ abịa na njedebe, egwu dagharịrị dịka a malitere tụwa onye ndu kọmịti ahụ lebara ya anya bụ Ndudị Elumelu aka iri ngarị. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: Ka nnyocha ahụ bịara na njedebe, naanị anọ n'ime ihe iri asatọ na asatọ kọmiti Elumelu tụnyere alo ka e mee bụ ihe e mere. 2. Nnyocha ebubo mmefu ego dị N628 eboro Patricia Olubunmi Etteh oge ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu nta E nyochara Patricia Etteh, onye bụbu onyeisi Ụlọomeiwu Nta n'afọ 1999 maka imefu N628m na ịrụzi ụlọ obibi onyeisi Ụlọomeiwu nta n'Abuja. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:E mechara jiri maka nnyoha ahụ chutuo Etteh n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Nta n'afọ 2009. Mana Lawan, onye bu nnyocha ahụ n'isi ma bụrụkwa onye ọtụtụ na-ahụta dịka onye na-akwụba aka ya ọtọ mechara maa na ọnya nrụrụaka dịka a chọpụtara na o riri ngarị. 3. Nnyocha ihe mere ego ụlọakụ Ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ mere nnyocha ụlọakụ dịga na Naijiria ma rụọ ụfọdụ ndị isi ụlọakụ gụnyere Erastus Akingbola, nke Intercontinental Bank, Cecilia Ibru nke Oceanic Bank na Bartholomew Ebong nke First Bank aka maka ebubo nrụrụaka n'ime ndị isi ụlọakụ. Ndị ọzọ bụ Francis Atuche nke Bank PHB,Sebastian Adigwe nke Afribank na Okey Nwosu. Nnyocha ijeri Naira 555( N555billion) ego batara n'akpa Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC) bido na Decemba 2004 na Eprelu 2007 n'oge ọchịchị Umaru Musa Yar'Adua. Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee: A chụrụ ndị isi ụlọakụ iri abụọ n'ọrụ, kpụpụ ọtụtụ ha ụlọikpe. E mechara tụọ Cecilia Ibru mkpọrọ ọnwa iri na asatọ ma nye ya iwu ka ọ kwụchigha ebe Erastus Akingbola onye ejichiburu na mkpọrọ gbatara isi onwe ya n'ụlọikpe kachasị. 4. Nnyocha Dasuki, Olisa Metu maka mmefu ego nchekwa Nke a mere ngwangwa Onyeisiala Muhammadu Buhari batara n'ọkwa ya n'afọ 2015. E boioro Sambo Dansuki ebubo imefu ijeri dola abụọ($2bn) bụ ego e kwesịrị iji zụọ ngwa agha maka ọgụ Boko Haram. Ndị ọzọ a rụụ aka n'ebubo ahụ gụnyere Chief Raymond Dopesi, nwee DAAR Communications PLC, aka chịburu Sokoto steeti bụ Attahiru Bafarawa, onye bụbu Mịnịsta nta na-ahụ maka eg Bashir Yuguda. Metu abiaghị n'ụlọ ikpe dị n' Abuja na ụbọchị Jenuwari 22 A rụkwa nwa afọ Igbo bụ Olisa Metuh aka n'ebubo ahụ si na o mefuru ego dị nde naira 400 . Ihe e jiri nchọpụta ahụ mee:A kpụpụrụ ndị a ụlọikpe maka ị zara ọnụ ha. E mechara tụrụ olisa Metu mkpọrọ afọ asaa maka ya. Nnyocha NNPC E nyochara ụlọọrụ na-ahụ maka mmefu ego dị tari atọ (3trillion naira) nke mere n'afọ 2016. Ọ bụ Ụlọomeiwu Ukwu n'oge Bukola Saraki bụ onyeisi ya hibere kọmiti lebara anya na nrụrụaka na-aga n'ụlọ mmanụ agbịdị na Naijiria ma mee Senetọ Jibrin Barau, onyeisioche kọmiti ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49984170,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984170,Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020,Okwu gbasara atụmatụ mkpata na mmefu ego nke Naịjirịa n'afọ 2020 ka na-ewu n'elu na ala.,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-eto onyeisiala Muhammadu Buhari maka iwepụta ya bụ atụmatụ n'oge. Buharị kwuru na ego dị tarị naịra iri na ụma atọ (N10.3 trillion) ka Naịjirịa ga-emefu n'afọ na-abịa abịa. E kere ego a ụzọ abụọ, nke a ga-eji arụpụta ọrụ a hụrụ anya (capital expenditure) nakwa nke a ga-eji egbo mkpa na-adpụta kwa mgbe kwa mgbe (recurrent expenditure). Ego e ji egbo mkpa dị tarị anọ na ụma asatọ ebe nke e ji arụpụta ihe a na-ahụ anya dị tarị abụọ na otu ụma. Mana ụfọdụ na-atamu ntamu na-ekwu na ego e wepụtara maka ụfọdụ ngalaba dị mkpa pere mpe. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka bọjetị 2020: 1) Ego mbite Ihe karịrị tarị naịra abụọ na ụma (N2.18 trillion) ka a ga-ebite ebite maka bọjetị nke afọ 2020. Nke a ka bekee kpọrọ 'Budget Deficit'. 2) Ego e ji ete ụgwọ mmanụ Onyeisiala kwukwara na ihe karịrị tarị naịra abụọ na ụma anọ (N2.45 trillion) ka e wepụtara iji tee ụgwọ Naịjiria ji mmanụ. Bekee kpọrọ nke a 'debt servicing'. 3) Mịnịstrị ahụike enweteghị ihe ọtụtụ tụrụ anya Ego onyeisiala wepụtara iji mepụta ihe a hụrụ anya na mịnịstrị ahụike n'afọ 2020 bụ ijeri naịra iri anọ na isii (N46bn). Nke a ka a na-akpọ 'capital expenditure' na bekee. Ego nke afọ a pere mpe karịa nke afọ gara aga. Afọ gara aga, mịnịstrị ahụike nwetara ego dị ijeri naịra iri ise na otu (N51bn). Ngalaba agụmakwụkwọ nwetara ijeri naịra iri anọ na asatọ (N48bn), ebe ngalaba nchekwa nwetara otu narị ijeri naịra (N100bn). 4) VAT arịala n'ezie A nubuola kepu kepu na gọọmentị etiti ga-ebuli ụtụisi nke a kpọrọ VAT, mana onyeisial kwuziri ya hoo haa. O kwuru na VAT arịala site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise. Dịka Buhari si kwuo, ego e tinyere na VAT ka a ga-eji ewulite ọnọdụ ahụike nakwa agụmakwụkwọ na Naịjirịa. 5) Bojetị ga-amalite Janụwarị Buhari kwuru na ihe ya ji wepụta Bọjetị 2020 ugbua bụ iji hụ na ndị omeiwu mechara ihe dị na ya tupu afọ a agwụ. N'otu aka ahụ, ndịomeiwu kwuru na ha ga-eme ka atụmatụ onyeisiala nwee isi. Nke a mee, ọ ga-abụ nke mbụ bọjetị afọ ọbụla na-amalite na-abalị mbụ nke ọnwa Janụwarị afọ ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ" afirika-51327831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51327831,Charly Boy Vs Willie Obiano: Gịnị na-esere Charly Boy na Gọvanọ Obiano?,"Ọ dịka Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti amaala n'ọnyịa dịka onye mbụ Charles Oputa ji emezu nkwa o kwere na ya ya ga-ebido 'kpọọ ndị sabo aha"" n'ihu ọha.","Na mkparitaụka Charly Boy na BBC Igbo nwere na nso nso o kwuru na ya ga-ebido kpọpụtawa aha ndị Igbo nwere agba amaghị eme. Oputa, onye a ma ama dịka Charly Boy, na-ebo Obiano ebubo ikwe nkwa eme eme. Iwe gbara Oputa dịka o nwegara Willie akwụkwọ ihe ya na steeti ahụ nwere ike ijikọ aka meere ndị ntọrobịa Anambara mana okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ. Charly Boy boro ebubo maka ọnọdụ pati APGA enweghị ụlọ nke ha, ndị ntorobịa enweghị ọrụ, ọnọdụ ọdọụgbọelu Anambara na ihe ndị ọzọ. N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya n'aha @areafada1, o kwuru na ""ọtụtụ na-ezitere m mkpesa maka etu Gọvanọ si achị n'Anambara."" ""Ndị mmadụ na-ekwu na APGA bụ pati gị enweghị isi ụlọọrụ nke bụ nke ha n'Ọka..."" ""I binyeela aka na nkwekọrịta karịrị 500 mana o nweghị nke mịtara ohere nye nde kwuru nde ndị ntorobia Anambara steeti."" ""Ụfọdụ na-ajụ ajụjụ banyere atụmatụ ibupụ ụgụ (nke Gọvanọ kwuburu na Anambara na-ebupụ ala Bekee), ma ọ bụzịkwa ihe e kwuru ka a na-eme?"" Charly Boy, onye gbara ama na Ya na Obiano gụkọrọ Sekọndrị bokwara Obiano ebubo ịhapụ APGA bụ pati Ndigbo na-egbunye n'akpa ndị otu APC. Ọ jụkwara ya Obiano ihe mere ọdọụgbọelu o kwere nkwa ịrụ. Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa Ihe Obiano sara ya Mana n'ọsịsa ya, Obiano gwara Charly Boy ka ọ hapụ agwa ụmụaka ma bido mewe ihe ka okenye n'ihi na nka abịala. Obiano, onye kwuru nke a n'ọnụ Kọmịshiona Mgbasaozi bụ Don Adinuba sị, ""Charly Boy dị afọ 70."" ""O ruola oge o kwesịrị ime ka Charly Man' ma hapụ Charly Boy."" Ọ gara n'ihu bo ebubo na ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị onye (activist) bụ ndị na-achọ nke ga-aba ha n'akpa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe maka nchụda Ihedioha" afirika-44776462,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44776462,Anambra: Onye na-ezu gọọmentị ohi ga-aga mkpọrọ,Gọọmentị Anambra steeti akwala arịrị n'ihi ohi ndị isi ụlọahịa dị iche iche na steeti na-ezu ha nke ruru ijeri naịra.,"Okwu si n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka azụmaahịa na steeti ahụ bụ Christain Madubuko na mkparịta ụka ya na ndịisi ụlọahịa akwa dị n'Onicha. Mgbe BBC Igbo gbara Madubuko ajụjụọnụ gbasara nke a, o kwuru na ọ bụ eziokwu. Madubuko kwuru na ụzọ ndị a si ezu gọọmentị ohi ego bụ ibipụta akwụkwọ azụmahịa adịgboroja na akwụbataghị ego ha kwesiri ịkwụ gọọmentị. Ọ gara n'ihu ṅụọ iyi na gọọmentị Anambra ga-eji ndị ha nwụchirila mee ihe ịmaatụ ka ndị ọzọ mụrụ akọ. O kwuru na a ga-akpọpụ ndị a n'ụlọikpe ma tụọ ha mkpọrọ ruru ha. BBC Igbo kpọrọ ụfọdụ ndị na-azụ ahịa ịjụ ha ajụjụ ọnụ mana ha azaghị. Kama otu onye na-arụ n'ụlọọrụ mbinye ego akpọrọ Silas kwuru na nke a bụrụ eziokwu na ọ bụ ihe ziri ezi n'ihi na ụtụisi ndịisi ụlọahịa na-ana ndị mmadụ dị ukwuu. Silas kwuru na ọ bụrụ na-akpọpụ ndị a n'ụlọikpe, hụta na ha daara iwu, na ọ bụ ihe ziri ezi ka tụọ ha mkpọrọ ma ọ bụ taa ha ahụhụ ruru ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43940126,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43940126,Ndị ụka Kraist arụgharịala ụka ekwensu na mba Brazil,Ndị otu Kraist enyela ndị ọdịnala a kpọrọ 'Candomblé' aka rụgharịa okwuarụsị ha na mba Brazil.,"Conceição d'Lissá na Lusmarina Campos ebe ha na-arụgharị ụlọ arụsị ahụ E nwere opeka mpe, wakpo asatọ e mere ndị Candomblé bụ otu ofufe ndị e rere n'ohu si Afrịka buga na Brazil n'afọ 2017. Ofufe ha na-akwado ịchụ aja, ịgụ egwu ofufe ha na inwe dibịa na-echekwa okwuarụsị ha dịka ndị na-efe arụsị na mba Afrịka dị icheiche sị eme. Nke a kpatara ndị ụka ọgba ọhụrụ dị ịcheiche jiri malite ịkpagbu ha, na-akpọ ha 'ndị ọrụ ekwensu' ma bido ibuso ha agha dị. Otu onyeisi nchuaja Candomblé bụ Conceição d'Lissá, so na ndị a wakporo okwuarụsị ya ugborougboro ma mebikwa ya. A wakporo ihe dịka okwuarụsị Candomblé asatọ n'afọ gara aga Lusmarina Campos bụ otu ụkọchukwu ekwenyeghị na mmegbu a na-emegbu ha na ndị ụka ya na-enyere ha aka ịrụgharị okwuarụsị ha ndị ọzọ gbara ọkụ. Otu onye so ha arụ ukwuarụsị ahụ bụ Celina Holtz kwuru na mbụ oso enye ndị ofufe Candomblé nsogbu maka na a kụziere ha na ndị ahụ na-efe chi ọjọọ. Holtz si, ""onweghị ihe m ma maka ha na mbụ, abịara m ugbu a ị mụta ọtụtụ ihe maka ha"". Mana ọ bụghị mmadụ niile ka ihe a dị mma n'obi. Ndị mmadụ na-aluso ndị ụka Kraist a na-enyere ndị ọdịnala aka ọgụ. Ihe onyonyo so akụkọ a bu ụzọ pụta na Websait BBC ọzọ" egwuregwu-44513788,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44513788,World Cup 2018: Mekziko egosila Jamini nkarị ma gbaa ha 1 - 0,"Ndị Mekziko na ndị Jamini zọrọ onye ga-ebu ụzọ nweta pọintị na tebulu ndị otu F, mana ọ bụ Mekziko meriri ma nweta pọintị atọ.","Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị n'ime elekere ole na-abịa, ka ndị Brazịla na Swizaland ga-agba nke ha. Egbuchiela bọọlụ. Nkeji 92: Neuer so pụta ịchọ ma ọ ga-enye goolu. Ogbu bọọlụ etinyela nkeji atọ Nkeji 90: Herrera enwetala akwụkwọ edo edo. Nkeji 88: Brandt a nwaala ike ya n'inye goolu, mana bọolụ pụrụ apụ. Nkeji 86: Jamini ewepụla Werner, tinye Julian Brandt. Nkeji 84: Hummels na Thomas Muller enwetala akwụkwọ edo edo, ebe Muller nwetara nke ya maka ịdọ Herrera aka n'uwe, Hummels nwetara nke ya maka ịgba mmadụ ụkwụ. Nkeji 82: Layun nwetara ezigbote bọọlụ, mana ọ gbafuru ya n'elu poostu. Nkeji 79: Jamini ewepụla Plattenhardt tinye Mario Gomez. Nkeji 77: Layun ebutela bọọlụ ka Jamini gbachara 'corner' na nke ha, gbapụ ọsọ, gbaa shọọtụ, mana ọ gbafuru agbafu. Nkeji 76: Jamini enwetala 'corner' abụọ n'ime otu nkeji, mana o nweghị nke bara na neetị. Nkeji 75: Kroos agbaala shọọtụ! Mana ọ chọtaghị neetị, bọọlụ pụrụ n'akụkụ neetị. Nkeji 73: Mekziko ewepụla Guardado tinye Rafael Marquez, nke ga-eme ya Iko Mbaụwa ise Marquez na-aga. Nkeji 70: Hernandez che na ọ ga-enweta penariti n'ihu poostu ndị Jamini, mana atụpụghịrị ya ọnụ. Nkeji 67: Jamini bịara nso inye goolu site n'aka Draxler, mana o nweghị isi. Nkeji 65: Mekziko ewepụla Lozano nyere goolu, tinye Jimenez. Nkeji 64: Kimmich nke Jamini agbaala shọọtụ, mana ọ banyeghị na neetị. Ọ gara n'elu ya. Nkeji 60: Ndị Jamini ewepụla Khedira tinye Marco Reus. Nkeji 58: Mekziko ewepụla Vela tinye Alvarez. Nkeji 56: Ndị na-akwado Mekziko na-egosi ha ezigbo nkwado, na-akpalite mmụọ ha. Nkeji 50: Jamini ebidola ịgba ka ọ bụ bọọlụ a ji ndụ ha. Nkeji 46: Egwu ebirila ọkụ ọzọ. Isi ndị Jamini ọ ga-apụtakwa? Nkeji 45 na ụma: Agbazuola akara nke mbụ, ebe Mekziko ji otu goolu na-emeri ndị Jamini. Nkeji 44: Ndị Mekziko na-egosi Jamini na ha abịaghị igwu egwu. Ha na-enye ha ezigbo nsogbu. Mana Jamini ka nọ na-agbafu bọolụ na-ebunye ndị Mekziko bọọlụ kama onye nke ha. Agbaala shọọtụ itoolu ruru nso poostu kemgbe egwuregwu a ji bido. Nkeji 40: Moreno enwetala akwụkwọ edo edo maka igbu oge. Nkeji 37: Jamini anwaala ike ha ịsa goolu e nyere ha, mana o nweghị isi. Nkeji 35: GOOOOOLLUUUUU! Mekziko agbakaala neetị ndị Jamini. Hernandez bunyere Lozano bọọlụ o ji gbakaa neetị ndị Jamini. Nkeji 26: Mekziko nwetara bọọlụ mara mma, mana Layun gbafuru ya n'elu poostu. Nkeji 22: Jamini na-agbasi shọotụ ike ịma ma ha a ga-enweta goolu, mana Ochoa ekwebeghị ha nweta efe. Kroos nwara ike ya, mana isi apụtaghị. Nkeji 17: Ọ dị ka Jamini enwetewala onwe ha maka na agbawala ka ndị goolu na-agụ agụrụ. Nkeji 15: Jamini enwetala 'corner', mana Ochoa ghọtara ya. Nkeji 14: Moreno ji isi taa bọọlụ ka Kroos ji aka butuo bọọlụ mere ka Mekziko nweta 'free kick', mana Neuer ghọrọkwara ya. Nkeji 12: Ndị Mekziko na-egosi Jamini nkarị n'egwuregwu a, ebe ndị na-akwado ha na-enwe ezigbo aṅụrị. Nkeji 10: Herrera agbaala shọọtụ, mana Neuer ghọtara ya. Nkeji asatọ: Mekziko enwetala 'free kick' mana Layun agbafuola ya. Nkeji atọ: Werner nke Jamini agbafuola bọọlụ o nwetara na-agabu nso poostu. Otu Nkeji: Mekziko agbapụla bọọlụ ibido egwuregwu ha. Nke a ga-eme ya ugboro anọ ndị mba Jamini na Mekziko ga-ezukọ n'asọmpi Iko Mbaụwa. Ndị nọ n'ocheJamini: Marc-Andre ter Stegen, Kevin Trapp, Ilkay Gundogan, Mario Gomez, Matthias Ginter, Antonio Rudiger, Leon Goretzka, Julian Brandt, Marco Reus, Niklas Sule, Sebastian Rudy. Ndị nọ n'oche Mekziko: Jesus Corona, Alfredo Talavera, Marco Fabian, Raul Jimenez, Jonathan dos Santos, Giovani dos Santos, Edson Alvarez, Rafael Marquez, Oribe Peralta, Jesus Manuel Corona, Javier Aquino, Erick Gutierrez. Ndị Jamini bidoro bọọlụ: Manuel Neuer; Joshua Kimmich, Jerome Boateng, Mats Hummels, Marvin Plattenhardt; Sami Khedira, Toni Kroos; Thomas Muller, Mesut Ozil, Julian Draxler; Timo Werner. Ndị Mekziko bidoro bọọlụ: Guillermo Ochoa; Carlos Salcedo, Hugo Ayala, Hector Moreno, Jesus Gallardo; Miguel Layun, Andres Guardado, Hector Herrera; Carlos Vela, Javier Hernandez, Hirving Lozano. Jamini na-agba ịma ma ha e nwere ohere ibuli Iko Mbaụwa ọzọ kemgbe ha bulichara ya n'afọ anọ gara aga. Ndewo! Daalụ maka isonye anyị n'egwu a." afirika-47774732,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47774732,Misery Index: Nigeria eso na mba iwe na ọnụma na-eto ndị mmadụ afọ?,A kpọpụtala Naijiria dịka mba nọ n'ogogo isii na mba ndị iwe na ọnụma na-achị eze.,"Steve Hanke, onye ọkammụta na mahadum John Hopkin dị na mba Amerịka bụ onye mere nchọpụta ahụ. Na ngụkọ Hanke mere, mba Venezuela bụ mba ọnụma kachasị na-asụ kwụtụ kwụtụ ka ofe. End of Twitter post, 1 Argentina, Iran, Brazil, Turkey na-eso ya, ebe Naijiria nọ n'ọnọdụ nke isii. South Africa sochiri Naijiria n'azụ dịka mba nke asaa. Bosnia na Hergergovian n'ọkwa nke asatọ, Ebe Egypt na Ukraine nọ n'ogogo nke itoolu nakwa iri. N'aka nke ọzọ, mba Thailand bụ mba kachasị enwe aṅụrị. Hanke kọwara n'ozi o wepụtara na Forbes na nchọpụta ahụ gbadoro ụkwụ na mgbakọta enweghị ọrụ, ọnụ ahịa ihe na-ada oke bụ nke Bekee kpọrọ ""inflation"" na ego ole a na-akwụ n'isi ego a gbazitere n' ụlọakụ bụ nke Bekee kpọrọ ""bank lending rate"". Oke ụbịam mere ka ọtụtụ ụmụaka na-arịọ arịrịọ Enweghị ọrụ ji pasent 18.8 kawanye njọ na Naijiria n'agba nke atọ nke afọ 2018 dịka mmadụ ruru nde 20.9 bụ ndị enweghị ọrụ, dịka ọnụ ahịa ihe na-ada bụ pasent 11.31 n'ọnwa Februwarị, afọ 2019, site na ngụkọ nke ngalaba na-ahụ maka ngụkọ bụ ""National Bureau of Statistics"" (NBS) si kwuo. Enweghị ọrụ na-ebute ọgbaghara, mpụ, iwe na ọnụma N'okwu ya, Uche Uwaleke, onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba kwuru na nchọpụta Hanke bụ ahụ n'anya e kwe. Uwaleke onye bụ onyeisi, ngalaba mmụta maka ego na ụlọakụ (Banking and Finance) na mahadum, ""Nasarawa State University"" kwuru n'ezie na ọnọdụ enweghị ọrụ, ọnụahịa nakwa ụgwọ a na-akwụ maka ego mgbazinye n'ụlọakụ dị elu na Naijiria. ""Anyị ma mmadụ ole nọ enweghị ọrụ. Anyị makwa ọ bụghị ihe ihe dara taa ka ọ na-ada echị nakwwa ụgwọ ana-akwụ i n'ego mgbazinye dị elu."" Gee ihe Uwaleke kwuru n'uju: Naijiria bụ mba ọnụma na-eto ndị mmadụ afọ n'ezie - Ọkammụta Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka okwu a: @The_Pineal kwuru n'ọnọ n'ọkụmmụọ. @janetfashlaw kwụrụ na ọnọdụ Naijiria ka njọ karịa ihe nchọpụta ahụ kwuru. @ComradesSteve kwuru na n'agbanyeghị na ya ji otu afọ efe ala a sị nọ n'ogogo isii dịka ndị ọnụma juru obi, na ya na ndị enyi ya na-enwere onwe ya aṅụrị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47787162,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47787162,Hard drugs: Ndị na-arụ ọgwụ ike agbarụọla mmiri ala n'Enugwu,"A na-asị na ""mmiri bụ ndụ"" mana ọtụtụ mmadu n'Enugwu ahụghị nke ha ga-aṅụ ka ndị na-akụ ọgwụ ike akpọrọ ""Methamphetamine"" ji mgbọrọgwụ gbarụọ ala.","Ọgwụ ike Enugwu Agbanyeghị na ndị si ngalaba na-ahụ maka ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchịela ndị a ma gbachie ebe ha nọ na-arụ arụ a, mmiri ala dị na mpaghara Trans-Ekulu emebiela. Calista Udomma Meka gwara BBC na ọ bụ otu onye aka kpara ebe o bu akpa ọgwụ ike efedrin gbara ama eji nwụchie ndị a na-akpa ike a, ma chọpụta ebe nsogbu mmiri ndị bi na Trans-Ekulu na-agabiga. NDLEA sị na onye nọ n'isi ndị na-akpa ike a bụ otu nwoke bi Saụt Afịrịka aha ya bụ Christian Chibuzor. Calista kwuru sị; ""Christian anọghị mgbe anyị gara ọrụ n'ụlọ ahụ, mana a hụrụ na ọ bụ ebe a na-akpọsa ụgbọala ka a nọ na-aku ọgwụ ike a."" ADD PHOTO Ndị e jidere n'ụlọ a bụ Christopher Eze, Ikechukwu Umahi na Paul Eze. Otu nwoke bi na mpaghara Phase 2 na Trans-Ekulu aha ya bụ Ogunedo Emeruole, gwara ndị ntaakụkọ Vanguard na ha ""bidoro hụwa mgbanwe n'ime mmiri ha na-ekute n'ọmị mmiri, mana tupu nke ahụ emee, anyi na-anụ ajọ isi si be agbataobi anyị."" Ọ sị: ""Anyị che na onye kwatara ọhụrụ gbara ọgwụ anwụ mana ya bụ ajọ isi akwụsịghị. ""O ruru mgbe anyị bidoro ịhụ mmanụ n'ime mmiri anyị na-ekute. Mmiri a na-esi ajọ isi. Ya mere anyị ji kpọọ ndị na-egwu ọmị, mana isi ahụ ka ha ike. ""Ọ tụrụ anyị n'anya mgbe ndị NDLEA bịara gwa anyị na o si n'aka agbataobi anyị."" ADD ANOTHER PHOTO Maazị Emeruole gara n'ihu kwuo na ha amaghị onye agbataobi ha a, makana ọ naghị apụta n'ime ụgbọala ya ma ọ bịa. Meka gwara BBC Igbo na a na-ere ọgwụ ike a na-arụpụta n'ụlọ a na mba ofesi. Agbanyeghi na ọ gwara BBC Igbo na gọọmentị Enugwu steeti nakwa nke etiti ma maka ihe mere, onweghi onye gọọmentị a kpọrọ zara ekwentị ya iji tinye ọnụ n'akụkọ a." afirika-54042663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54042663,Akanu Ibiam Airport Enugu: Amalitebeghị ịnabata ndị njem na ya,"Ka izuụka abụọ gachara kemgbe agbapere ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu, ụgbọelu bu ndị njem efetubeghi ebe ahụ.","Arụchabeghi ebe ndị njem si efepụ Ọ bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọstụ ka minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika gbapegharịrị ọdọụgbọelu Akanu Ibiam. Ụbọchị ahụ mere ya otu afọ na ụbọchị isii a gbachiri ya maka ịrụgharị okporoụzọ ụgbọelu si ada. Dịka Maazị Sirika na-eme emume mgbape ọdọụgbọelu ahụ, ọtụtụ mmadụ na-ekiri ya n'akara BBC Igbo na Facebook, jụrụ ihe mere e ji agbape ebe arụchabeghị arụcha. Ajụjụ ahụ sitere n'igwe eji arị elu gbara ụlọezumike n'ọdoụgbọelu ahụ okirikiri. Ụfọdụ mmadụ nọbu ekwu na o nweghị ihe nke ahụ mere, dịka ụgbọelu nwereike na-ada ka ọrụ na-aga n'ihu. Site n'akaekpe: Okwy Nwodo Gọvanọ Enugwu steeti na mbụ, Chief John Nnia Nwodo PG Ohaneze Ndigbo, onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti na Minista ọrụ na inwe ọrụ, Chris Ngige, Onye bụbu osote onyeisioche na Sineti Ike Ekweremmadu, Onye nnọchịteanya Isuikwato/Umunneochi Federal Constituency, Abia steeti n'ụlọomeiwu nta Nkiru Onyejeocha, Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti. Mana, BBC achopụtala na kemgbe ahụ emechara emume mgbape ahụ ụgbọelu efetụbeghị ebe ahụ. Otu onye na-arụ ọrụ n'ime ọdọụgbọelu ahụ gwara BBC na ha mabu na agaghị amalite njem n'ọdọụgbọelu ahụ. ""Ọ bụ ka ha mepee ya tupu ọ gachaa otu afọ agbachiri ya mere ha jiri gbaa mbọ gbapee ya n'Ọgọstụ."" Onye ahụ achọghị ka e kwuo aha ya sịkwa na ha na-ele anya na e nwereike imalite njem na ọdọụgbọelu ahụ na ngwụcha ọnwa Ọgọstụ. Mana Henrietta Yakubu bụ onyeisi ndị na-ekwuru ngalaba a kpọrọ ""Federal Airports Authority of Nigeria"" (FAAN) gwara BBC na ihe mere ejighi malite njem n'Akanu Ibiam esighi ha n'aka. Ọ sị: ""Anyị mechiri Akanu Ibiam maka okporoụzọ, ugbua arụchara ya, ọ dịrịla njikere maka njem."" Ka BBC jụrụ ya maka ihe kpatara ụgbọelu ejighi efetu maọbụ efepụ n'ebe ahụ, ọ sị na nke ahụ ga-esi ụlọọrụ ụgbọelu n'aka. ""Ha kwesịrị iwete ""schedule njem ha"", mana onwebeghị onye wetere nke ha. Nke gosiri na ha adịbeghị njikere. A rụchabeghị otu n'ime ụzọ ebe e si abata na ya bụ ọdọụgbọelu N'ajụjụ igwe gbara ebe ahụ okirikiri, Odoziakụ Yakubu sị na usoro ha ma ha na-arụ ụdịrị ọrụ ahụ bụ itinye ihe Bekee na-akpọ ""tent"" iji hu na njem na-aga n'ihu. Ọ sị na tupu izuụka a agaa, a ga-ewepụchaa igwe ndị ahụ. Stanley Olisa bụ ọnụ na-ekwuru Air Peace gwara BBC na ọ bụ ndị gọọmentị ka ọ dịrị inye ụlọọrụ ụgbọelu ikike ịmalite njem n'ọdọụgbọelu ahụ. O kwenyere na ya bụ ọdọụgbọelu adịrịla njikere maka njem, ma kwukwaa na ụlọọrụ Air Peace na-agba mbọ ka ha hụ na njem malitere n'Akanu Ibiam." 52686605,https://www.bbc.com/igbo/52686605,'Nnamdi Kanu na-arụrụ gọọmenti Naịjirịa ọrụ' - Ralph Uwazuruike,Ralph Uwazuruike bụ onyendu ndị Moverment for the Survival of the Sovereign State of Biafra (MASSOB) a saala Nnamdi Kanu okwu ọ gwara ya.,"N'edemede pụtara n'akwụkwọ akụkọ Punch ụbọchị Fraịde, Onye mgbasaozi MASSOB bụ Sundau Okereafor dọrọ Nnamdị Kanu aka na nti sị ya kwusi ịkparị onyeisi MASSOB bụ Ralph Uwazuruike. Ọ sịrị Kanu na ọbụrụ na ike dị ya, ya lọta Naịjiria bịa zọwa mnwereonwe Biafra, karịa ị nọ n'ofesi na-eme ọnụ. Okereafor kwuru na Kanu enweghi ike iweta Biafra ma ọ nọrọ n'ofesi. Gee Ralph Uwazuruike ntị n'olu ebe a 'Nnamdi Kanu na-arụrụ gọọmenti Naịjirịa ọrụ' - Ralph Uwazuruike Mgbe BBC kpọrọ Ralph Uwazuruike ịmata ma ya bụ okwu Okereafor kwuru ọ nọ n'izu ha. Uwazuruike sị na ọnweghị mgbe ya ji zie Okerefor ya gbachitere ya n'aka Nnamdi kanu. O kwukwara na Kanu abịaghị ịzọta Biafra n'ezie maka na ọ ịbịara ịkpasa ihe ha na-eme. Mbọ niile BBC gbara ịnwete ndị otu Kanu maka ịzara ọnụ ha kpụrụ afọ n'ala. Akụkọ ga-amasị gị Coronavirus Update: Ihe mere m ji agụrụ ndị m na-agwọ covid 19 egwu- Dọkịta Igwe" afirika-43579989,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43579989,PIBG: Mmanụ ụgbọala nwere ike ịda ọnụ,"Ọ bụrụ na onyeisiala Muhammadu Buhari kwado, iwu ọhụrụ ụlọomeiwu Naijiria tinyere aka maka ihazigharị mmepụta na ire mmanụ n'ala anyị ga-eme ka ọnụ mmanụ ụgbọala gbalite.","Ụkọ mmanụ ụgbọala bụ nsogbu ekweghị ala ala na Naịjiria N' ụbọchị Wenezde, abali 28 nke ọnwa maachị, ụlọomeiwu nke etiti tinyere aka n'akwụkwọ iwu ịhazigharị mmepụta na ire mmanụ na Naijiria nke a kpọrọ Petroleum Industry Governance Bill (PIGB), na bekee nke kwadoro ka a na-akwụ ụtụ pasenti ise na mmanụ ụgbọala. A ga-etinye ụtụ pasenti ise a, a ga na-akwu na mmanụ ụgbọala na akpaego ngalaba nke e mebere maka iji kwụghachi ndị oremmanụ ọghọm ọbụla ha nwetara site na ire mmanụ otu ọnụ dịka gọọmenti siri hibe nke a kpọrọ Petroleum Equalisation Fund (PEF). PIGB bụ iwu mapụtara otu aga-esi na achi ma na-ahazi mmanụ ala na Naijiria. Iwu ahụ kwukwara ka e kerie ngalaba na-ahụ maka ire mmanụ n'ala Naijiria nke a kpọrọ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC), na bekee ma wepụta nglaba ọhụrụ a kpọrọ ,'Nigerian Petroleum Regulatory Commission."" Iwu a nke e bidoro okwu ime ya n' afọ 2000 oge ọchịchị Olusegun Obasanjo butere ọtụtụ esemokwu n'etiti ndị omebeiwu nke mere o jiri nọọ odu ma nwekwa mmegharị dị icheiche. Akụkọ ga-amasị gị:" 49374981,https://www.bbc.com/igbo/49374981,Ndị gburu Paul Offu na Clement Ugwu nọzị anyị n'aka - Ndị uweojii Enugu,Ndị uweojii sị na ha ejidela ndị omekome gburu fada Paul Offu na ndị ọzọ gburu Fada Clement Ugwu.,"Ibrahim Adamu na Idris Tobe bụ ndi uweojii sị n'aka ha dị ogbugbu Fada Offu Mmadụ abụọ a ejidere ma gosi ndị nta akụkọ maka ogbugbu Fada Offu bụ Ibrahim Adamu, onye gbara afọ 25 na Idris Tobe, dị afọ 28. Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kwuru na ha dị mmadụ ise aka ha dị ogbugbu fada Paul Offu, ma kwuo na ha jidere nanị mmadụ abụọ n'ime ha, ebe mmadụ atọ bụ Garuba Basulugu, Mohammed Lagu nakwa Mojapan Duna riri mbọ mbọ ọsọ. Ndị omekome ndị uweojii ji maka ogbubu Fada Offu n'Ugwu Balarabe kwere nkwa na ya na ndị ọrụ ya ga achọpụtarịrị ndị niile gburu ndị fada n'Enugu ebe ọsọrọ ha gbaga. Idris Tobe gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọ bụ n'Enugwu ka amụrụ ya mana ya bi n'Okigwe ugbua. Ọ gakwara n'ihu sị na aka ya adịghị n'ogbugbu Fada Offu. Gọvanọ Enugwu gara njem ịleta gburugburu ebe ndị omekome na-akpa ike na mpaghara Ọgwụ N'aka nke ọzọ, cheta na mmiri ribidoro ndị ntọrị gbagburu fada Clement Ugwu ka ndị uweojii jidere mmadụ atọ n'ime ha n'Lagos. Ndị ntorị ogbu mmadụ ahụ ejidere bụ Sunday Chibuko 32, onye Ezeagu, Benjamin Asogwa 38, onye Obollo Eke nakwa Wasiu Ajomale, onye ogun state. Onye nke anọ a na-achọ achọ bụ Kelechi onye Oji River. Wasui Ajomale kwetara hoo ha na ọ bụ ha gagburu fada Clement Ugwu. Lee akụkọ a n'uju Anyị ejidela ndị gburu Fada Clement n'Enugwu - Ndị uweojii Ogbugbu ndị fada a, ntọrị igwe ndi Agbogugu nakwa mpụ ndị ọzọ kpatara ndị fada jiri mee ngagharịiwe n'Enugwu ma mekwaa ka ndị Fulani na-achị ehi họpụta ụbọchị abụọ iji gbasaa ozi. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe" afirika-48906226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48906226,Ruga Settlements: Ndị ugwu atụzịla anyị aka n'ihu' - Ọgbakọ ndị Igbo,"""Association of South Eastern Town Unions"" asaala mmaja ọgbakọ ndị ugwu majara gbasara atụmatụ ruga.","Ha dọkwara aka na ntị sị onye Igbo ọbụla eresila onye ọbụla ala buru ibu. N'otu aka ahụ Wole Soyinka nakwa Ooni na-achị Ife bụ Oba Ogunwusi adụọla ụmụ Naịjirịa ndụmọdụ gbasara ya bụ atụmatụ. Ha sị ndị mmadụ mee ihe niile dị n'ike ha ịchekwa ala nna ha n'ebe rugu nọ. Na mba ofesi Mba Greece enwetala Praim Minista ọhụrụ bụ Kyriakos Mitsotakis mgbe otu ya bụ New Democracy meriri ntụlaịka ala ahụ. N'Afrịka, Mandla Maseko na-akwado ịbụ onye Afrịka mbụ ga-abụ ihe Bekee kpọrọ Astronaut anwụọla na mberede ọgbaa tumtum. N'egwuregwu, . Dịka akụkọ pụtara na ọtu CAF mere Chidozie Awaziem nakwa Kenneth Omeruo nyocha maka ọgwụ ike, BBC achọpụtala nke bụ eziokwu. Onye ntaakụkọ BBC bụ Oluwasina Okeleji kwuru na ya bụ nyocha abụghị ihe ọhụrụ. O kwukwara na emere ya ndị ọgba bọọlụ ndị mba ndị ọzọ a họpụtara. ""O nwebeghi onye dara nyocha a kemgbe ebu ụzọ malite ya bụ asọmpi AFCON"" ka o kwuru. Mba Amerịka ebuliela ịkọ mbaụwa ụmụnwaanyị nke ụgbọrọ anọ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie mba Netherlands mgbe ha zutere onwe ha. Nkeji nke ututu a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị'" 43929011,https://www.bbc.com/igbo/43929011,Onyeisiala Buhari ga-aga Amerịka maka ọgbakọ ya na Trump echi,Onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Amerịka ga-enwe ọgbakọ ụbọchị Mọnde 30 Epreel.,"Ọgbakọ a bụ onyeisiala mba Amerịka kpọrọ ka ha nwee ya Ọgbakọ ahụ ga-elebe anya n'etu a ga-esi hazie mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ nakwa itinye uche na ihe gbasara mba abụọ ahụ dịka ikwalite akụ na ụba obodo, iluso ndị oyi egwu ọgụ na ndị na-echere udo na nchekwa obodo aka ngba. Ha ga-enwe ọgbakọ ahụ n'ehihie, e mesia, Buhari ga-enwe ọgbakọ ọzọ n'etiti ndị mara ihe ekwe na-akụ gbasara ọrụugbo na imepụta ihe. Ndị isi gọọmenti Naịjirịa n'akụkụ ọrụugbo na njem ala na nke elu na ndị ụlọ ọrụ ndị mba US emeela ọgbakọ tupu Buhari agawa. Ndị Naịjirịa na ndị Boeing bụ ndị kachasị emepụta ụgbọelu n'ụwa niile ga-enwekwa ọgbakọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50373315,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50373315,Child Marriage: Ọghọm dị n'alụmdi nwa nwata na Naijirịa,Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ United Nations Children's Fund (UNICEF) akpọọla oku maka ụmụnwaanyị Naịjirịa.,"Ha kwuru na Naịjirịa aghọrọla mba nke abụọ ebe ịlụ nwata nwaayị ka di elu nakwa mbụ na mba Afrịka niile. Nyocha ha mere gosiri na ihe ruru ụmụnwaanyị nde iri abụọ na atọ (23 million) lụrụ di mgbe ha dị na nwata. O kọwara na di alụrụ na nwata a so na ihe mere ka ụmụaka kwụsị ịgụ akwụkwọ maọbụ agụghị akwụkwọ chaachaa. Na Naịjirịa otu n'ime nwata ise anaghị agụ akwụkwọ nagbanyeghị na iwu ala hibere agụmakwụkwọ Primary n'efu. Cheta na nwunye aka na-achị Bauchi steeti bụ Aishatu Mohammed kwuru na ọ dị sọsọ afọ iri na isii mgbe ọ lụrụ di ya. O kwukwara na ọ gachabeghị akwụkwọ mgbe ọ lụrụ di. Gịnị na-ebute alụmdi na nwata? Otu onye na-azọ oke ruru mmadụ bụ Akinropo Akinola kọwara na alụmdi na nwata a kachasị dị njọ na mpaghara ugwu Naịjirịa. O kwuru na ụfọdụ ihe na-eme ka alụmdi na nwata na-aga ihu n'agbaneyghị na gọọmenti Naịjirịa mere ya ka ọ bụrụ ihe dara iwu n'afọ 2003 gunyere: E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye? Ọ bere arịrị n'ugbua, ọha anaghịzi etinye anya na ọzụzụ nakwa nchekwa nwata dịka ọ dị n'oge gboo. O kwuru na n'ihi etu ọha mmadụ si dịrị taa, o nweghi onye chọrọ ịma ma ihe ọjọọ na-eme agbatobi ya nke mere na ndị na-alụ nwa nwaanyị na-anwata n'ala n'efu. Na ngwụcha, ọ kpọkuru gọọmentị oku ka ha tinye anya hụ na iwu ala mere ya mfe ịlụ ọgụ ma gbapụta ụmụ nwata nwaanyị nọ na alụmdi nwata. Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye" afirika-54892132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54892132,Kenechukwu Okeke: Aka ndị Igbo adịghị n'akwụkwọ nwamadị a gbara ndị so mee nbgagharịiwe SARS,Otu a kpọrọ 'Otu 'Conference of Igbo Youth Professional Worldwide' sị agọnarịla Kenechukwu Okeke maka ịkpụpụ ndị so mee ngagharịiwe EndSARS n'ụlọikpe.,"Kenechukwu Okeke bụ onyeisi otu ọ kpọrọ 'Good Governance Initiative' N'ozi onyeisi otu a bụ Maduabuchi Nwodo wepụtara sị na nwoke a abụghị onye otu ha, na-amaghị onye ọ bụ na mpaghara Ọwụwanyanwụ. Ọ sị na ndị kwadoro ka Okeke gbaa akwụkwọ a bụ ndị na-achọghị ọdịmma ndị Naịjirịa, chọrọ imebi aha onyeisiala n'ihu mbaụwa. Otu a gwara ndị Naịjirịa gbaa Okeke na ndị nkwado ya nkịtị na agwa abụghị ihe Naịjirịa chọrọ ugbua. Lee ndị Kenechukwu kpụpụrụ n'ụlọikpe maka ngagharịiwe EndSARS Flavour, Yul Edochie, Phyno Dịka okwu gbasara ngagharịiwe 'End SARS' nke e mere na Naịjirịa n'izuuka ole na ole gara aga ka na-aga n'ihu, otu onye a kpọrọ Kenechukwu Okeke, akpụpụla ndị so hazie ngagharịiwe ahụ ụlọikpe. Ndị aha ha dị n'akwụkwọ ikpe ahụ gụnyere: Aisha Yesufu, ụkọchukwu ụlọụka DayStar bụ Sam Adeyemi, ndị otiegwu Peter na Paul Okoye (PSquare), Chinedu Okoli a ma dịka ""Flavour"" na Chibuzor Azubuike a ma dịka Phyno. 'Anọ m n'ihu ụlọ m, mgbe ndị agha gbara m egbe' Ndị ọzọ bụ Folarin Falana (Falz) Bankole Wellington (Banky W), Innocent Idibia (2Face), David Adeleke (Davido), Ọkpaọchị Debo Adebayo nke a ma dịka Mr Macaroni,"" ọgbaabọọlụ Kanu Nwankwo, onye ejije Nollywood bụ Yul Edochie, na ọkaiwu Feyikemi Abudu. Aha ndị ọzọ dịkwa n'akwụkwọ ụlọikpe ahụ bụ: Ọkammụta Joe Abah, Onye ejije Uche Jombo, otiegwu Tiwa Savage, onye ntaakụkọ Kiki Mordi, nakwa onye Ọkpaọchị Ayodeji Richard Makun (AY). N'akwụkwọ ụlọikpe ahụ nke Kenechukwu tinyere n'akara Twitter ya, o boro ndị haziri ngagharịiwe a ebubo na ha haziri ọgbakọ ezighị ezi n' iwu. Okeke kwukwara na e mebiri ọtụtụ ihe ya n'ọgbaaghara dapụtara na ya bụ ngagharịiwe. 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ' Onye bụ Kenechukwu Okeke? Etu Kenechukwu si kọwaa onwe ya na Twitter Tupu akụkọ a apụta n'ehihie Tuzde, onwechaghị onye ma aha a bụ Kenechukwu Okeke, kama nwa amadi a kọwara onwe ya dịka onye na-akwado ikike dịịrị onye nke a na-akpọ 'human rights activist' na bekee. Okeke dekwara na ya bụ onye ozi Chineke ma bụrụkwa 'Eze Nri', nke a nwere ike ị na-arụtụ aka na ọ bụ onye Nri nke dị n'Anambara steeti. N'ọnwa Mee afọ a, nwa amadị a bụ Kenechukwu kwukwara na ọ ga-akpọpụ ndị uweojii ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha amaliteghi inyocha ndị otu ha maka ọrịa isi mgbaka. O kwuru nke a n'ihi akụkọ pụtara oge ahụ maka nwata nwaanyị ndị uweojii gbagburu. N'ọnwa Jenụwarị afọ 2019, Kenechukwu Okeke gbara gọvanọ Anambra steeti akwụkwọ, ma na-ekwu na etu o si wepụta bọjeetị nke afọ ahụ adabaghị adaba n'iwu Naịjirịa. Ọzọkwa, n'ọnwa Ọgọst 2019, ya bụ nwata nwoke kpọpụkwara gọọmentị Anambra steeti ụlọikpe maka mmachi ha machiri ndị na-agba ọgbaatumtum ụkwụ atọ, nke a ma dịka Keke. Ihe ụfọdụ ndị a gbara akwụkwọ a na-ekwu maka ya Aisha Yesufu kwuru na obi bụ ya sọ aṅụrị n'ihi na aha ya bụ nke mbụ n'akwụkwọ ahụ. Otu onye aha ya bụ Pamilerin Adegoke kelere Chineke na aha ya dị n'akwụkwọ ahụ Omoyele Sowore na-ajụ kedụ ụbọchị ya bụ ikpe ga-amalite ka ha gawa agawa. @Tissann_ kwuru na ọ ka mma ka a gbaa onye ntorobịa ọbụla nọ na Naịjirịa akwụkwọ" afirika-46198457,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46198457,Anambra Impeachment: Onye bụ onyeisi ụlọomeiwu iwu kwadoro?,Mgbagwoju anya pụtara dịka akụkọ kwuru na ndị ụlọomeiwu Anambara steeti chuturu onyeisi ha bụ Rita Maduagwu ma họpụta Ikem Uzoezie dịka onyeisi ọhụrụ.,"Onye bụ onyeisi ụlọomeiwu Anambara? Ajụjụ ndị Anambara kpụ n'ọnụ ugbua bụ onye bụ onye ụlọomeiwu iwu kwadoro? Ọ bụ Rita Maduagwụ ka ọ bụ Ikem Uzozie onye bụ onye na-anọchite Agụata nke a sịrị na ndị omeiwu họpụtara ọhụrụ? N'ụbọchị Tuesde, Nọvemba 13, ndị omeiwu Anambara ruru 20 n'ime 30 ka asị chụdara onyeisi ha maka ebubo ọchịchị aka ike, arụghị ọrụ dịka o kwesịrị na mmefu ego. Mana, Maduagwu gọrọ ma gwa ndị ntaakụkọ n'ụlọọrụ ya na ya ka kwụ chịm chịm. O kwuru na mbọ ichutu ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi na ndị mere ya agbasoghi iwu. N'okwu ya, ha enweghị ike ichutu ya na akpọghị ya oku bịa zara ọnụ ya n'ebubo ha boro ya. Na nkọwa ya, onye ọkaiwu bụ Obele Chuka kwuru na ọ bụrụ n'ezie na ndị omeiwu ahụ zuru iri abụọ n'ime iri atọ dịka akụkọ siri kwuo, na nchutu ahụ bụ ihe ọ bụ. Obele ,onye bụbu onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu ngalaba nke Anambara((NBA, Anambra) kwuru na ọ dịzịri onye mkpebi ha amasịghị ị ga ụlọikpe ka e kpegharịa ya. ""Ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ha zuru iri abụọ n'ime iri atọ, ọnụọgụ ahụ ezuola iwepụ onye ọbula ha achọghị n'ihi na ọ bụ ihe gbasara ha."" ""Mana ị marala n'ụfọdu ha sị na ha dị iri abụọ ,echi ha dị asatọ, ụfọdụ agọ aka na ụkwụ ha."" ""Iwu kwuru na ị ga-atụ onye mere ihe njọ ya n'ihu tupu ịwepụ ya, ọ bụrụ na ha atụghị ya njọ ya n'ihu ọ gawa n'ụlọikpe."" Kedụ ka ihe siri kwụrụ ugbua? Obiano kwụnyere Rita Maduagwu O doro anya na gọvanọ na-achị Anambara bụ Willie Obianọ akwadọghị nchụda ahụ. Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara steetị bụ Edon Adinuba gwara BBC Igbo na Rita Maduagwu ka bụ onyeisi ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ agbanyeghị etu e siri nwaa ịchụtu ya n'oche. Mana okwua apụtaghị na udo alọghachila n'ụlọomwiwu steeti ahu. Kama enwere ndị kwe na ndị ekweghị. Ka ọ dị ugbua, ndị omeiwu 11 sonyere na ndị kwadoro Madụagwu. Ndị a bụ ndị nọnyere ya dịka ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Oka ,isiobodo steeti ahụ na mgbede Tuuzde. Nke a pụtara na ọ bụzị mmadụ 19 bụ ndị akwadoghị nchụda ahụ. Dịka iwu Naijiria siri kwuo, ọ bụ ụzọ abụọ n'ime ụzọ atọ ụlọomeiwu nwere ike ịchụda onyeisi ha. Maduagwu azaghị BBC Igbo oge anyị kpọrọ ya n'ekwe nti ya nke ọ na-asa ozi anyị zigaara ya. N'otu aka ahụ onyeisi Komiti mgbasaozi nke ụlọomeiwu bụ Kingsley azaghị kwa anyị . Ka o sila dị,ọ bụ ụbọchị Tọzde, Nọvemba 15, bụ ụbọchị ụlọomeiwu higharịrị na ha ga-agbakọ ọzọ ka a ga-ama mbe na abụọ nke bụ oke. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48123910,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48123910,Kaduna-Abuja road: Mohammed Adamu agbanwela onyeisi ndị uweojii na Kaduna,Kọmịshọna ndị uweojii na Kaduna steeti ga-eburu akpa ya gaa Abuja ugbua dịka ahaziri ọnọdụ ya.,"Onye e tinyre ga-anọchị anya ya bụ kọmishọna Baụchi steeti bụ Aji Ali Janga. Onyeisi ndị uweojii bụ Moihammed Adamu kwurụ na nke a so na atụmatụ eji chee ndị ntọ aka mgba. O ji ohere ahụ gwa ndị kọmịshọna ndị ọzọ ha kee nkwụcha gbasara ntọ, izu ohi na mpụ ndị ọzọ na-eme n'obodo. Ụmụnwaanyị Ogoni enwela mmeri mbụ E chere na akwọgburu dị ụmụnwaanyị a maka nkatọ ha katọrọ mkpamkpa Shell na-akpa n'ala ha. Ụmụnwaanyị ahụ kpụpụrụ ụlọọrụ bụ odogwu na mmanụ agbịdị bụ Shell ụlọikpe maka ebubo na aka ha dị n'ọnwụ di ha. Ndị ọkaikpe na Hague kpebiri na ikpe nwereike ị gaa n'ihu ma kagbuo mkpesa Shell ka akwụsị ya bụ ikpe. Ihe ụmụnwaanyị abụọ gụnyere Esther Kiobel na Victoria Kiobel chọrọ bụ ka Shell rịọ mgbaghara n'ihu ọha ma kwụọ ha ụgwọ ahụhụ ha tara. Ken Sarowiwa so na otu onye katọrọ etu ndị ụlọ ọrụ Shell si ahazi ihe gbasara mmanụ , ha gburu ya site n'ikwu ya ụdọ n'afọ 1995 Di ha nwụrụ n'afọ 1995 mgbe ọchịchị ndịagha Naịjirịa kwọgburu ha n'ụdọ dịka ekpere ha ikpe ndị mmadụ kpọrọ adịgboroja. Ndị ọkaikpe kwukwara na Shell ga-ewere akwụkwọ ụfọdụ nzuzo nyefe n'aka ha. Ha gara n'ihu nye ụmụ nwaanyị ahụ ohere ịgosi ihe akaebe ga-akwado ebubo ha boro Shell. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43291843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43291843,Enugwu steeti nọ n'agbụ ugbua - Kenneth Okonkwo,"Onye na-eme ihe nkiri bụ Kenneth Okonkwo nke eji ""Andy Okeke"" mara ekpebiela na ya ga-azọ ọchịchị ọkwa gọvanọ steeti ya bụ Enugwu n'afọ 2019.","Kenneth Okonkwo na-azọ gọvanọ Enugwu n'okpuru pati APC Kenneth bụ onye Nsukka dị n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụ mmasị ya ime ka Enugwu steeti ga n'iru dịka oru nkiri ha bidoro na Naịjirịa si gaa n'iru. Kenneth so na ndị bidoro ọrụ nkiri na Naịjirịa dịka o sonyere na ihe nkiri e mere n'asụsụ Igbo a kpọrọ ""Living in Bondage"". Kenneth Okonkwo kọwara BBC Igbo na ihe nkiri o na-eme bidoro ka ihe egwuregwu na ihe iji nwe aṅụrị na-abụghị akaọrụ mana ọ gara nkeọma bụrụ ihe mepụtara ihu Naịjirịa. O kwuru na dịka ya siri ga n'ihu n'ọrụ nkiri ka ya siri chọọ ime ka Enugwu steeti gaa n'ihu. Kenneth katọrọ ọchịchị gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi bụ aka na-achị Enugwu steeti kwuo na ndị Nsukka anaghị enwe aṅụrị n'ọchịchị ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na naanị ofọ anọ ka ya chọrọ ịchị. Ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị APC. Ihe ndị ị na-amaghị maka Kenneth Okonkwo 1. Ọ bụ onye Nsukka dị n'Enugwu steeti. 2. O mere agwa Andy Okeke n'ihe nkiri a na-akpọ ""Living in Bondage"" nke e mepụara n'afọ 1992. 3. Ọ bụ onye ọkaiwu, ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum UNN nakwa UNILAG. 4. Ọ lụrụ nwa ụkọchukwu ya n'afọ 2000 mana ha gbara onwe ha alụkwaghị m n'afọ 2002. 5. Ọ mụrụ ọkpara ya n'afọ 2016 ka ọ gasịrị afọ itoolu ọ lụrụ nwunye ya nke abụọ Ifeoma Okonkwo. Kenneth esonyela ndị na-eme onyonyo bara ndọrọndọrọ ọchịchị Kenneth nwere nkwado aka chịburu Enugwu bụ Sullivan Chime Ndị na-eme ihe nkiri na Nollywood dịka Desmond Elliot, Kate Henshaw na ọtụtụ ndị ọzọ esirila na ihu TV banye ọrụ gọọmenti na steeti ha dị icheiche. Kenneth Okonkwo gwara BBC Igbo na ya nwere ntụkwasị obi na ndị Enugwu ga-akwado ya dịka aka chịburu Enugwu Sullivan Chime kwadoro ya. N'aka nke ọzọ, onyeisi pati APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na Kenneth pụrụ imeri ntuliaka n'afọ 2019. Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nọ pati PDP dịka ọchịchị ya ugbua bụ nke mbụ." afirika-47610129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47610129,Rochas Okorocha: Ọ ga-eso ndigbo nwere ike ịbụ 'Senate President'?,"Site na mpụtara ntuliaka onyeisiala na nke ndị ụlọomeiwu, ndigbo na-atụ anya na-akpọkwa oku ka e nye ha ohere ka nwa afọ igbo bụrụ onyeisi ụlọomeiwu.","National Assembly: O ruru nwafọ Igbo ịbụ onye Sịnetị - Uwazuruike APC nwere ndị Sịnetọ dị iri isii na atọ, PDP nwere ndị Sịnetọ iri atọ na ise ebe YPP nwere naanị otu onye Sịnetọ. Onye ọkaiwu ma bụụkwa onye ọ nụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọọ ọchịchị bụ Goddy Uwazuruike kọwara na ọ bụ ndị ọnụọgụgụ ha kachasị nwere ikike ịhọpụta onye ga-abụ onyeisi. O kwuru na ọkwa onyeisi ndị Sịnetọ kwesiri ị bịara Ndigbo mana ndị mpaghara Ugwu nwere ike ha agaghị ekwe ka nke a mee. O kwuru na ""Mgbe Naịjirịa nwere onwe ya, na ọ bụ mkpebi ndị ndu n'oge ahụ ka a na-eke ọchịchị nhatanha. Mana kemgbe onyeisiala nọ ugbua bụ Muhammadu Buhari banyere o megharịala usoro ndị ahụ"". Uwazuruike kwuru na ọ na-atụ anya na e nwere onye Igbo bụ Sịnetọ n'APC, na ọ ga-enwere ike inwete ọkwa a. Ụfọdụ Ndigbo a na-atụ anya nwereike ịbụ onyeisi na Sịnetị Orji Uzor Kalu Ọ bụ aka chiburu Abia Steeti afọ asatọ n'aha PDP nakwa PPA bụ nke o hiwere. Ọ meriri na ntuliaka ọkwa Sịnetọ ga-anọchite anya mpaghara Abia North n'aha pati APC. Kalu a natala asambodo gosiri na ọ bụ ya meriri na ntuliaka ahụ n'aka ndị Inec nke mere ya onye kachasị enwe ohere inwete ọkwa onyeisi Sịnetị ma ọ bụụ nae nye ya Ndigbo. Bejamin Uwajimogu Bejamin Uwajimogu na-anọchite anya mpaghara Owerri North n'ụlọomeiwu Sịnetị n'aha APC. Ọ bụ ya na-anọchite anya mpaghara Owerri-North n'ụlọomeiwu Sịnetị n'aha APC. A mabeghi ma o nwereike imeri na ntuliaka ọkwa Sịnetị e mere dịka ndị Inec kwuru ka e megharịa ya n'ihi ọgbaghara. Dịka ọ dị ugbua, ọ natabeghị asambodo mmeri n'aka ndị Inec. Ya mere o tozubeghị oke inweta ọkwa a. Rochas Okorocha Rochas bụ gọvanọ na-achị Imo Steeti kemgbe afọ anọ gara aga n'aha APGA nakwa APC. O ji aha APC zọọ ọkwa Sịnetị ga-anọchite anya mpaghara Owerri West mana onye ọrụ Inec kwuru na Rochas magidere ya ịkpọpụta dịka onye meriri na ntuliaka ahụ. Ebubo a bụ nke Rochas gọnarịrị mere ka Inec jụ inye ya asambodo gosiri na o meriri. N'ihi nke a Okorocha etozubeghi oke inwete ọkwa onyeisi Sịnetị. Ibeawuchi Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43593559,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43593559,"Iko mbaụwa 2018: Briten, Naijiria agaghị enwe referii","Fifa ahọrọla mmadụ ịrị atọ na isii maka asọmpi mbaụwa ga-eme na Rọshịa mana o nweghị onye n'ime ha si Ịngland, Skọtland, Wels maọbụ Nọden Iaịland nke a na enwe onyee Naijiria.","Howard web gburu asompi nke EPL nke Chelsea na Liverpool nke a gbara na Stamford Bridge na London nke Mikel Obi soro gba n'ọnwa Novemba 11,afọ 2012. FIFA họrọ ndị Afrika isii n'ime ndị ga-egbu referii, ebe mmadụ iri bụ ndị nnyemaka referii sikwa Afrịka, mana onweghị nke bụ onye Naijiria. Mark Clattenburg bụbụ sọsọ otu onye Briten nọ n'akwụkwọ ndị ọrụ Fifa nke edọkọtara n'afọ 2016, ebe e siri họrọ ndị ga-arụ ọrụ na Rọshịa. Mana ọ hapụrụ ọrụ ya na Premia Ligi, ọnọdụ ya laa. Clattenburg, onye rụrụ ọrụ n'asọmpị Yuro 2016 nke ikpeazụ ebe Pọtụgal meriri Fransi bụ ndị anọ be ha gba ya, hapụrụ ọrụ ya n'ọnwa February afọ 2017 ga bụrụ onyeisi ndị referii ndị Saudi Arabia. Otu ndị bọọlụ nke Briten rịọrọ Fifa ka ha weta onye ọzọ ga-anọchi ya, mana Fifa jụrụ ajụ. ọnweghị otu kwụrụ onye Briten so na mmadụ iri isii na atọ na-arụ ọrụ dịka ndị nyemaka referii, ebe a ga-ahọrọ ndị referii bụ ndị nnyemaka ihe nkiri n'ime ndị ọrụ ahọpụtarala maka asọmpị ahụ. Nke a ga-abụ mbụ a ga-eji nnyemaka ihe nkiri na iko mbaụwa. Emeghị asompi iko mbaụwa afọ iri na abụọ ka afọ 1938 gachara n'ihi Agha mbaụwa agba nke abụọ. Mana kemgbe ebidokwara ya ọzọ n'afọ 1950, a na-enwe opeka mpe, otu onye referi bụ onye Briten n'asompi ahụ. Nwa afọ Ingland bụ Howard Webb bụ naanị onye Briten nọ n'iko mbaụwa ikpeazụ agbara n'afọ 2010 na 2014. O gburu bọọlụ n'asọmpi ikpeazụ nke afọ 2010 mgbe Spain meriri Nedalands na Saut Afịrika. Abịa n'akwụkwọ Fifa, ọ bụ otu bọọlụ na otu ndị referii na-ejịkọ ọnụ wepụta ndị ha chọrọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48957414,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48957414,Igbo Folktales: Kedu uru akụkọ ifo baara Ndigbo?,Akụkọ na egwu Mike Ejiagha bụ ụzọ akụkọ ifo ndị Igbo ka ji dị ndụ taa.,"Nke a mere BBC ji dee edemede a maka akụkọ ifo iji kpọllite mmụọ ndị ọgbara ọhụrụ n'ihe gbasara akụkọ ifo. Anyị gara hụ ndị ọkammụta n'Igbo na Mahadum Legọs ka ha kọwaara anyị ihe bụ akụkọ ifo na uru ọ bara. Egwu Chinyere Amaka Ifechukwu Gịnị bụ akụkọ ifo? Ada Anachebelu bụ onye nkuzi na ngalaba Afịrika na Eshia na Mahadum ahụ kọwara akụkọ ifo ka: ""Otu n'ime ngalaba agụmagụ ọnụ ndị Igbo nwere. Ọ bụ akụkọ ekere uche nke gbadoro ụkwụ n'ihe emeghị eme, gbado ụkwụ n'agwa mmadụ, agwa anụmanụ na agwa ndị mmụọ. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha, ma na-azụlite ha n'usoro ebimndụ, omenala na nkwenye ndị Igbo."" Ebele Okafor Onye nkuzi na Mahadum Legọs Ebele Okafọr nke Mahadum ahụ kwenyekwere na ""akụkọ ifo bụ akụkọ ọ dị n'ala nke bidoro na oge gboo, ma gbado ụkwụ n'ala mmadụ, ala anụmanụ n'ala mmụọ bụ nke eji akụziri ụmụaka ezi omume"". Onye ọja Gerald Eze Gịnị ka a na-ahụ n'akụkọ ifo? Ọkamụta Chigozie Nnabụihe nke Mahadum ahụ kwuru na ọ bụ n'ime akụkọ ifo ka a na-ahụ ""omenala, ahụmihe ụwa, ọdị na mbụ, ọdị mgbe ochie, ọ dị be ndị ndị nwe akụkọ ifo ahụ"". Chigozie Nnabuihe Onye nkuzi na Mahadum Legọs Nnabuhie sị na ihe mere eji akọ ifo n'ọnụ bụ ederede abịabeghị mgbe ebidoro ya mgbe gboo, bụ nke mere eji sị n'aka nne na nna na-enyefe ya ndụdụgandụ, nke ga-abụ ihe ga-edu ya na ndụ ya na ọ dị n'ihu. Nnabuihe sị na Ifo bụ mkpụrụ a na-akụ n'echiche ụmụaka ka onwere ya too, banye ya n'ime, banye ya n'ime mmụọ, banye ya n'akparamagwa. Killiwee Nwachukwu Uru akụkọ ifo baara ndị Igbo Ada Anachebelu Kedụ ihe mere na akụkọ ifo na alazị? Nchọcha Ada Anachebelu gosiri na ọtụtụ nne na nna enweghịzị mmasị na ebe agụmaagụ na omenala ndị Igbo dị. Nke a mere na ha anaghịzị ewepụtara ya oge ikuziri ụmụ ha. Ụfọdụ nne na nna nwere mmasị enweghịzị ohere n'ihe ọnọdụ akụ na ụba obodo Naịjirịa dị. Gịnị bụ ọfọ? Ọtụtụ ndị Igbo enweghịzị mmasị n'isụ asụsụ Igbo. Ada Anachebelu sị na, n'ihe nke a akụkọ ifo enweghịzị ọnọdụ n'ebe ọtụtụ ndị Igbo nọ. Okwukwara na itufu akụkọ ifo ga-enye ezigbo nsogbu n'ịzụlite ụmụaka ugbua. Gịnị ga-eme ka mmasị gbagolite ọzọ? Itinye akụkọ ifo na nke Bekee kpọrọ ""Cartoon"" ga-enye aka ime ka mmasị ụmụaka gbagolite ọzọ n'akụkọ ifo. Lee ihe nkiri Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48720259,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48720259,AFCON 2019: Lee 'ụmụanụmanụ' ga-achịpụ ya n'asọmpi AFCON 2019,"Ọ bụ ụmụanụmanụ, kpakpando na ndịagha ga-achịpụ ya na mba Pharoah dịka asọmpi Iko mba Afrịka nke ugboro 32 ga-ebiri ọkụ.","Ebe a ma ụfọdụ ụmụanụmanụ a ka ndị na-akpa ike, ndị nke ọzọ bụ ndị a ma maka ịdị nwaayọ Isi akụkọ bụ na ọtụtụ n'ime mba 24 na-azọ Iko mba Afrịka nke afọ a nwere aha e ji mara ha nke bụ aha ụmụanụmanụ. Ugbua, n'agbanyeghi na e nwere ọtụtụ ọdụm n'Afrịka ndị dịka Ọdụm nke Atlas na Ọdụm nke Teranga mana Ọdụm nke Indomitable ka bụ eze nwe ọhịa. Aha otutu abụghị naanị maka ịkpa ọchị n'egwuruegwu bọọlụ kama ọ bụ ihe dị oke mkpa n'egwuregwu bọọlụ Afrịka tinyere nmuke ndị nkwado na ịgba ha na-eti. Aha otutu nke otu egwu bọọlụ bụ oke ihe nye mba Afrịka, ọ bụghị naanị na ọ bụ ihe njirimara nye ndị nkwado ha kama ọ na-akwalite mmụọ ndị ọgba bọọlụ. Lee 'Ụmụanụmanụ' ndị a Ụmụanụmanụ pụtara ihe n'aha ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ tozuru oke n'AFCON nke afọ a, ọkachasị ugo. Naịjirịa - bụ ndị e ji uwe agwa ndụndụ mara mana aha otutu ha - NnukwuUgo bụ nke ka ada ụda. Aha otutu a si n'ugo dị na njirimara Naịjirịa, na mbụ ha na-aza 'Green Eagles'. Malị - aha e ji mara ha bụ Ugo ebe Tunisịa na-aza Ugo nke Carthage makana ugo bụ otu n'ime ihe gbapụtara ihe e ji mara mmepeanya ndị 'Carthage'. Chekeleke nkeUganda bụ mba ọzọ so n'AFCON 2019 nke aha otutu ha bụ nnụnụ a. Ndị Ivory Coast na-aza 'Enyi' Agha ụmụanụmanụ n'ime oke ọhịa Ebe mba ndị nọ na mpaghara Yurop na-azakarị aha otutu site n'agwa uwe egwuregwu bọolụ ha, ndị nke Afrịka na-aza nke ụmụanụmanụ nọ n'oke ọhịa. Site n'ọdụm ruo agwọ, agụ ruo enyi, ha niile 'gbara kasa' n'asọmpi AFCON nke afọ 2019 a. Afrịka na-akwanyere ndị Eze, ndị Agha na Kpakpando ugwu Ụmụnwoke siri ike na ndị Eze na-amasị ndị Afrịka, ya mere e ji baa ụfọdụ otu egwuregwu ndị a aha ha. A ma Ijipt dịka 'Pharaohs'; njirimara mmepụta obodo nakwa ọchịchị Eze, nke gosiri na ha bụ ""Igwe na-achị Afrịka"" maka etu ha si bụrụ ndị kacha buo Iko AFCON (ha ebuola ya ugboro asaa). Mohamed Salah bụ onye na-agbara mba ha bọọlụ bụ Ọkacha agba nke CAF na BBC nke afọ a. Ndị 'Warriors' nke mba Zimbabwega-anwa ike ha dịka ha ga-ezute ndị Eze nke Ijipt n'ime egwuregwu bụ nke e ji emepe asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ a. E jikwa akara igwe mara ụfọdụ mba Ihe ọzọ na-ewu ewu na mpaghara Afrịka bụ ndị na-aza aha akara igwe. A ma ndị nke mba Kenya dịka 'Harambee Stars'- Harambee n'asụsụ Swahili bụ olumba ha, pụtara ""ịdọkọta ọnụ"", aha otutu na-akpọku mba ha na otu egwuregwu ha ka ha nwee otu obi. A ma otu egwuregwu ndị Ghana dịka 'Black Stars' maka agwa kpakpando dị n'ọkọlọtọ mba ha, nke bụ nke ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ kwenyere ga-eme ka ndịnotu bawanye. Ngwanụ ka asọmpi biri ọkụ. Kedụ ndị ị chọrọ ka ha merie? Họrọ ebe a: Iko Mba Afrịka 2019: Họọrọ ndị i che ga-agwọ ibe ha ka abacha Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" egwuregwu-48891962,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48891962,Cameroon vs Nigeria: Ndị nkwado agbataobi abụọ a agaghị achịsa onwe ya ọchị taa,Kameroon ga-ezute Naịjirịa n'obodo Alexandrịa taata bu ụbọchi nke isii nke ọnwa Julaị.,"Ndị otu nkwado Super Eagles nke akpọrọ ""Fan Club"" egosila obi ụtọ ha n'ebe Super Eagles nọ site na izukọta n'Alexadrịa Egypt were egwu n'ọṅụ n aekwuputa na Naijiria ga enwe mmeri. Kemgbe afọ 2000, Kameroon emeribeghị Naịjirịa n'asọmpi bọọlụ ọbụla. Na nzute 22 mba abụọ a bụ agbatobi ọ bụ sọsọ ugboro anọ ka Kameroon nwetere mmeri. Mmeri atọ n'ime anọ ahu bụkwa na mgbacha Iko Mba Afịrịka. Dịka Madagaska ji okpu abụọ chara ọku merie Naịjirịa n'agba nke mbụ, ha ga-achọ iji asọmpi a hicha ihere. Kameroon n'onwe ha nwetere nhatanha n'asọmpi ha na mba Bene gbara agbanyeghị na ọ bu ha kacha gbaa na ya bụ asọmpị. N'afọ a, ha agbara asọmpi asaa. N'ime ha, onweghi nke emeriri ha. Ndị nwereike pụta n'ọgbọ Ka osina dị, ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị nwere olilanya na asọmụmpị Naịjirịa na Kameroon a ga-adị ezigbote ọkụ. Asọmpị a ga-eso n'elekere ise nke mgbede. Ndị na-akwado Naịjirịa jukwara n'ọgbo n'Ijipt iji nye ha nkwado pụrụ iche. Lee Ndị ""Fan Club"" Super Eagles ebe ha na-agba egwu n'Alexandria Egypt. Nke a bụ egwu ọṅụ ha ji ekwu na Super Eagles ga enwe mmeri Lee Ndị ""Fan Club"" Super Eagles ebe ha na-agba egwu n'Alexandria Egypt. Nke a bụ egwu ọṅụ ha ji ekwu na Super Eagles ga enwe mmeri Ama ndị nkwado Super Eagles na ụwa dum maka ọṅụ na mmacha ha jị abịa asọmpị Lee kwa etu ndị Super Eagles ji na-ekele ndị Naịjirịa" afirika-49290191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49290191,AMCON Debtors List: 'Ihe mere aha anyị ji dị na ndị ji gọọmenti ụgwọ',Onyeisiala Naijịrịa bụ Muhammadu Buhari agbanweela iwu nke nyeziri ngalaba n'ahụ maka igba ụgwọ ikike i gwa ndị ụlọakụ ka ha nye ha ohere inyocha obaego ndị niile ji gọọmentị ugwọ.,"Onyeisiala Buhari enyela ngalaba Gọọmentị dịka AMCON,ICPC na EFCC inyocha obaego niile ndị ji AMCON ụgwọ Ngalaba gọọmentị ndịa bụ Asset Management Corporation of Nigeria (AMCON) , Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), Nigerian Financial Intelligence Unit (NFIU) na kwa Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) . Gọọmentị na agba mbo inatacha ụgwọ eji AMCON mana iwu ochie nke agbanwere ugbua enyeghị ha ikike ha chọrọ. Mana ka ọ dị ụgbụ a, ha enwtala ikike ha chọrọ. AMCON edepụtala akwụkwọ na mbụ nke gosịrị aha ndị jị ha ụgwọ, BBC gbara otu n'ime ha ajụjụ ka ọ gwa anyị uche ya. Ugo Egboji - Petrologistics Limited Ugo Egboji onyeisi ụlọọrụ Petrologistics gwara BBC otu iwu ọhụru a sịrị metuta ya. O mere ka anyị ghọta na: ""Iwu a dị mma maka na ọ ga-eme ka AMCON nata ụgwọ eji ha"" Egbujọ 1) ""Ụgwọ a e ji bụ ụgwọ e ji ndị ụlọakụ"" 2) ""Ọtụtụ ụgwọ a bụ nke sitere na mgbere akụ ụlọọrụ na-ere mmanụ agbidi nke a gbara n' ụlọ mgbere ahịa a kpọrọ ""Stock Market."" 3) ""Dịka Naịjirịa nwere ọtanisi(Recession) n'afọ 2008 nke metụtara ọtụtụ ụlọọrụ, gọomentị kwesiri ili ụlọọrụ ndị a, ihe Bekee kpọrọ 'Liquidation,"" dịka a na-eme na mba ndị ọzọ."" ""Mana ha emeghị ya n'ihi na gọọmentị achọghị ka ụlọakụ ga daa."" 4) ""Ndị ji ụgwọ a karịrị puku ise"" 5) ""AMCON na-eme ka ọ dịrị gọọmentị mma, ọ dịrị ụloakụ mma ma dịkwara ndị ji ụgwọ mma."" 6) ""N'agbanyeghị nke a, e nwere ndị na-achọghị ikwu ụgwọ a ma ncha."" 7) ""Aha e deputara na Intanetị nsonso a bụ ọrụ ndi ntaakụkọ umengwụ n'ihi na aha ndị a bụ aha ochie e depụtara."" 8) ""E depụta aha ndị ji ụgwọ ọhụrụ i ga ahụ na ọbụghị aha niile ka i ga ahụ na ya."" Dika ihe a si gbasata iwu, Okaiwu bụ Nwabufo Ikechukwu kọwara na ọ bụghi nani onyeisiala denyere atụmatu a n'iwu, kama ndị Omeiwu ga eweputa iwu tupu onyeisiala edenye ya n'iwu Naịjiria. 'Ọ bụ ndị Omeiwu ga-ebụ ụzọ gbanwee iwu tupu Onyeisiala edenye ya n'iwu.' Nwabufo Nwabufo gara n'ihu kọwaa kwa na iwu a bụ ndezighari iwu AMCON nke di bụ mbụ. O gara n'ihu kọwaa na tupu edegharia iwu a, ndi gọomenti enweghi ikike igwa ndi uloakụ ka ha nye ha ohere i nyocha ma banye obaego ndia ji ụgwọ. O kwuru na iwu ọhụrụ a ga enyezi ndị gọọmenti ikike inyocha obaego ndia ji ugwọ na enweghi mgbochi obụla dika iwu ochie AMCON na egbochi ha. Nwabufo gwara BBC na n'uche obi ya, iwu a bụ ezigbote ihe, kama ka a n'ele ma ọ bụ otu nri si esi ka ọ ga esi tọọ. Lee Akụko Ga-Amasị Gị - Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị - Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium" afirika-50385914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50385914,World Pneumonia Day: Naịjirịa bụ mbụ na ndị ọrịa a kacha egbu ụmụaka ya,"Dịka a na-eme ncheta gbasara ọrịa Pneumonia, dọkịta Joshua Akinde ekwuola na hoha ọ bughị oyi na-ebute ọrịa ahụ.","Dọkịta Akinde kwukwara na ya bụ ọrịa na-emekarị ụmụaka makana ikike ha ji achụ ọrịa esichaghị ike. Mana gịnị bụ Pneumonia? Dọkịta Akinde kwuru na ọ bụ ọrịa na-emebi ngụgụ. O kwuru na mgbe nje dịka vairọs, fọngaị nakwa bakterịa gadoro ngụgụ mmadụ , ihe na-eso ya bụ Pneumonia. Oyi a naghị ebute ya. Akinde kwuru na ya bụ ọrịa nwereike isi n'otu onye fee onye ọzọ tụmadị ọ bụrụ nke na-ebu ụkwara nta abịa. O kwuru na ọ bụghị oyi na-ebute ya kamana nje na-ebutekarị ya na-eme ọfụma n'ime mmiri ozizo nakwa ebe juru oyi. Ka ị ga-esi gbochi ya Cheta na ndekọ ọhụrụ nke ngalaba UNICEF wepụtara gosiri na otu nwata nwuru kwa nkeji iri atọ na itoolu site n'ọrịa a. O gosikwara na ụmụaka mba Naịjirịa mezuru ọnụ ọgụgụ 162,000 n'ime 800,000 nwuru n'ime afọ gara aga nke bụ ọnụ kachasị. Onye nnọchite anya UNICEF na Naịjirịa bụ Pernille Ironside kwuru na ""Pneumonia bụ ọnwụ na-egbukarị ụmụaka n'agbanyeghị na ọ dị mfe ịgwọ"". Ọ kọwara na ihe ndị na-ebutekarị ọrịa a bụ erighị nrị zuruoke, mgbarụ ikuku n'ime ụlọ site n'isi nri n'ime ụlọ nakwa mgbarụ ikuku n'ezi. Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42935958,https://www.bbc.com/igbo/42935958,Ekwesịrị itinye anya n'ihe gbasara ọdọ ụgbọelu Asaba?,Onye na-achị Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ekwuola na ọdọ ụgbọelu dị n'Asaba ga-ebido ịrụ ọrụ n'ime ọnwa anọ nke na-abịa.,"Ifeanyi Okowa bụ gọvanọ nke atọ na-enyocha ọdọ ụgbọelu nke a Okowa kwuru nke a n'ọgbakọ ndị otu PDP nwere n'obodo Kwale dị na mpaghara Delta North. Ọ bụ n'ime ọchịchị gọvanọ James Ibori n'etiti afọ 1999 na 2007 ka e bidoro ikwu okwu gbasara ịrụ ọdọ ụgbọelu nke a. Echiche gọomenti Delta bụ ịrụ ọdọ ugbọelu nke a, ka o ruo ọkwa akpọrọ 'Category C Airport' n'olu bekee, ga-ebu ụgbọelu nke dị ichiche. Mana nsogbu dịka ebe a ga-arụ ya bụ ọdọ ugbọelu n'ime Delta steeti kwusirị ya bụ ọrụ n'oge ọchịchị James Ibori. Gọvanọ Emmanuel Udughan mechara bido ịrụ ọdọ ụgbọelu a n'afọ 2008 n'Asaba. Uduaghan kwuru oge ahụ na ọdọ ugbọelu nke a ekwesịghị ịbụ ihe echefuru echefu. Arụọla yabụ ọdọ ụgbọelu, mana ugbua, orubeghị etu ọ kwesịrị ịdị. Ihe ndị mmadụ na-ekwu BBC Igbo kpọrọ otu onye bi na Asaba, jụọ ya ihe o chere gbasara mmepegharị ọdọ ụgbọelu a n'ime ọnwa anọ na-abịa. Okwuru sị ""ekweghi m na enwere ike imepenwu ọdọ ụgbọelu a n'ime ọnwa anọ a maka etu ha si arụ ọrụ, ha na egbu oge. ""Ka ha si arụ ọrụ, onwere ike iru ọnwa asaa tupu ha arụchaa ihe ha bidoro, ""Ha na-arụkwa ọrụ o, mana ị ma etu gọọmentị si arụ ọrụ, ha dọbachara ụgbọala trailer ebe ahụ iji gosi na ha na-arụ ọrụ, mana onwebeghi ihe ha mewere. ""Ụfọdụ oge, ụgbọelu na-efeda, ụfọdụ oge ha-ekwuo na ha mechiri emechi.""" afirika-46057216,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46057216,"Minimum wage: Gọọmentị ga-akwụrịrị anyị N30,000","Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ ""Nigeria Labour Congress, NLC"" agwala onye ọbụla ka ha kwadoo makana abụbọ ọrụ nke ugbua ga aka aka n'ahụ.","Ihe onye NLC kwuru Onye isi oche NLC n'Enugwu steeti bụ Virginus Nwobodo kọwara na ha ekwekọrịtaka na ọbụrụ na ndị gọvanọ akachie ntị sị na ha agaghị akwụ N30,000, abụbọ orụ nke ike ya ga amalite n'ụbọchị 6 Nọvemba, 2018. Nwobodo kwuru na mgbe ya bụ abụbọ ọrụ ga-amalite, ha bụ ndị orụ ga-akwụsị ndị na-azụ ahịa, ụgbọ ala ma ọ bụ ụgbọ elu agaghịagba, ụmụ akwụkwọ agaghị aga, ụlọ ụka agaghị emepe, ebe ụlọ ọgwụ ga akpọchikwa.Onye ọrụ oyibo ahụ kwara arịrị na ebere adịghị gọọmenti n'obi inye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ji ezinaụlọ N18,500 dịka opekatampe ndị ọrụ. Nwobodo dọrọ ndị gọvanọs aka na ntị ka ha tulee na N22,500 ha chọrọ iji bido kwụwa ndị ọrụ ezughị inye ụmụ aka nrị, kwụọrọ ha ụgwọ akwụkwọ, ụgwọ ụlọ ọgwụ, idozi onwe ha nakwa ịkwụ ụgwọ ụlọ. Nsogbu ndị kwe na ndị ekweghị dị n'etiti ndị ọrụ na ndị gọọmentị bụ nke na-aga n'ihu ka mgbe afọ ole ma ole gara aga. Ka ọ dị taa, ndị gọvanọ ekwuola hoha na ha agaghị akwụlị N30,000, na ọ bụ N22,500 ka akpa ha ga ebuli, ma otu ndị ọrụ kwuru na ha ekweghị na nkea. Otu Ndị ọrụ ahụ bụ NLC na aha ịchafụ kwuru na ndị gọvanọ na gọọmenti etiti na-etufu ego na ihe ndị ọzọ ma leghara ndị ọrụ ha anya. Nwobodo nyekwara nne na nna ndụmọdụ ka ha jide ụmụ ha n'ụlọ, ma kwadoo onwe ha maka ya bụ abụbọ orụ ga-eweta ịkpọchị Naịjiria izu ụka na abia nụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44098246,https://www.bbc.com/igbo/44098246,Twitter enwurula ọkụ maka okwu ndị 'Yahoo',"Akụkọ na EFCC nwụchiri ndị Yahoo 12, ebulitela ndọrịtaụka maka ndị a ji aghụghọ anara mmadụ ego ya na soshal midia.","EFCC bụ ngalaba gọọmenti etiti na-enyocha onye ọbụla na-eme mpụ na mmerụaka na Naịjirịa Ụbọchị Satọde, aka kparala ụmụnwoke 12 ji aghụghọ anara mmadụ ego ha a na-akpọ 'Yahoo-Yahoo' n'ụlọ oriri na nkwari dị na Legọs. Ndị ụlọọrụ EFCC natakwara ha ụgbọala iri oge ha wakporo ha dịka ụfọdụ n'ime ndị a hapụrụ ụgbọala iri ha ""na-acha n'anya"" gbalaga. Mana dịka ọtụtụ ndị Naijiria na-akatọ agwa ndị Yahoo-Yahoo ma kwuo na ọ bụ ifee ego kpatara 'Yahoo-Yahoo' na mmerụaka ji arị elu na Naijiria, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ ọnọdụ Naijiria butere ajọ agwa a. Otu onye kpọrọ onwe ya Ohimai Godwin Amaize, kwuru na Twitter na ""Ebe ọ bụrụhaala na ịda ogbenye dịka mpụ na Naịjirịa, ebe ọ bụ na a na-akparị mmadụ maka na ọ bụ onye ogbenye, ma na akatọ ya, ""O buru na inweghị ego, ga-zo ihu gi, anyị na akpa ọchị ikwu na anyị chọrọ ikwụsị Yahoo-Yahoo na mmerụka!"" Onye ọzọ nyere aha ya dịka Mandem, tụrụ arịrị na ugboro ugboro ya na ndị mba ofesi na-akpa nkata azụmahịa ma ""ngwangwa ha chọpụtara na m bụ onye Naijiria, ha agbanyụọ ọkụ n'ihi ndị a a kpọrọ Yahoo-Yahoo."" Demola kwuru,"" A zụrụ m laptọp, gị azụọ. A zụrụ m modem, gị azụọ, E goro m internet, gị egoo. M'abụrụ onye ji ihe ndịa na emepụta ihe, gị nwa e jiri nke gị ghọọ nwoke Yahoo. Ihụla na ọ bụghị Naijiria butere ya. Ọ bụ ihe ị chọrọ ka ị hụrụ. I bụ onye ohi."" Mana ihe kara mee ka Twitter nwuru ọkụ bụ okwu Noble Igwe kwuru na Twitter ebe ọ katọrọ ndị Yahoo ma kwuo na ọtụtụ ụlọ oriri dị na Victoria Island bụ ebe ndị Yahoo na-agbakọ. Okwu ya kpara otu onye a kpọrọ Oyemyyke iwe nke mere o ji mee ihe nkiri na-akpọrị Noble Igwe. Lee ihe ndị ọzọ kwuru maka okwu a kpụ n'ọnụ: Miss poetic kwuru na ya ghọtara na ndị Yahoo bụ ndị ohi ndị a chọghị ịgba mbọ, kama ha na-agbawa ndị mmadụ aka ma na-emebi aha ndị Naijiria na-akwụwa aka ha ọtọ, mana ya aghọtaghị ndị na adọnyere ha ukwu sị na ọ bụ ihe kpatara ha ji etinye aka n'ihe ọjọọ a. Dịka ụfọdụ na-akatọ ndị oji aghụghọ a nara mmadụ ego ya, ụfọdụ na-ekwuchitere ha sị na ọ bụ ọnọdụ mere azụ mgbakọ. Good Civillan Emose kwuru na ọ bụ ndị ajọ ndị ndu kwanyere ha n'ọnọdụ ahụ. Ụfọdụ kwuru na ndị Yahoo ji ego ha nwetara atọ mkpa. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43834023,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43834023,Ugwuanyi: Ndị ọchị ehị nabata ịzụ ehi n'ala akpapụtaara unu,Gọvanọ Ụgwuanyi kwuru nke a na nzụkọ ndị ''Watchman Catholic Charismatic Renewal Movement(WCCRM)'' mere n'Enugwu.,"Ugwuanyi bụ onye pati PDP, nke nọbụ n'ọchịchị na Naịjirịa Ọ sị n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ihe gbasara ihe ụka bụ ụkọchukwu Chinedu Nwoye kwuo nke a. Ụgwuanyi sị na ọ bụ ihe nwute na ana-kpọ ndị ọchị ehi ndị Fulani. Onwere ihe ga-akwụsị mkpamkpa gbasara ịchị ehi? ""Ọ bụ makana ọ bụghị onye Fulani ọbụla bụ ọchị ehị.Ụfọdụ n'ime ndị Fulani bụ ndị ụkọchụkwụ ma bụrụkwa ndị ezigbo mmadụ.Ọtụtụm mmadụ echezọna na ọnye bubụ onyeisiala Naijirịa akpọrọ Umaru Yar'Adua,onye Katsina steeti bụ onye Fulani ma bụrụkwa ezigbo mmadụ mepụtara ezigbo ihe mgbe ọ nọ n'ọchịchi. Gọvanọ Ugwuanyi yọkwara ka ndị ụkọchukwu kpere ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ekpere. ""Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-agbara ndị n'ọchịchị ọsọ maka ụjọ na-aga ghọtaghie ha mana a nama gwa ha ka ha bido kpewere ndị n'ọkwa ọchịchị ekpere ka obodo Naịjirịa dimma. ""Ọ bụrụ na Chukwu buru ụzọ n'ihe niile Enugwu steeti na-eme ,ihe ndị ọzọ ga na-agaa siriri werere. Mmachị ọchị ehi Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" afirika-45218395,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45218395,Naijiria: Anyị ejịghị ego gbapụta ụmụaka Dapchi,Mịnịsịta okwu mgbasaozi dị n'aka bụ Lai Mohammed ekwusiela ike na gọọmenti etiti enweghi mgbe ha nyere onye ọbụla ego maka mgbapụta ụmụaka Dapchi ndị Boko Haram tọọrọ.,"Otu United Nation ekwuola na nyocha ha mere gosiri na gọọmentị Naịjirịa kwuru ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi a tọọrọ n'ọnwa Febụwarị. Dika otu ahụ siri kọwa, inye ego soo ewelite mkpamkpa otu Boko Haram na-akpa na mpaghara Naijiria na Chad. Nke a bụghị mbụ mmaọ̄ụ na-ekwu na gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ndị Boko Haram ụgwọ maka mgbapụta ụmụaka Dapchi ahụ Mana Lai Mohammed gọrọnarịrị sị na Naịjirịa ma kwuo na ọ nweghị ego e ji gbapụta ụmụaka Dapchi. O kwuru ka onye ọbụla na-ekwu ụdị ihe ahụ wepụta ihe ngosi akaebe kpatara o ji ekwu ya. Ụmụakwụkwọ Government Girls Science and Technical College, Dapchi, Yobe Steeti ebe ndị Boko Haram tọrọ mmadụ 110 N'okwu ya; ""O zughị ibo Naijirịa ebubo na ọ kwụrụ ego, obere maọbụ nnukwu. Ọ ga-enwerịrị ihe mgbado ụkwụ ga-egosi ihe ndị ahụ. Mana ọ bụrụ na o nweghị ihe ngosi ọbụla, ị mara na ọ bụ 'nkonuko' ka ndị mmadụ na-eme. Lai Mohammed si n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Segun Adeyemi wee kwuo ihe ndị a n'abalị Tọọsde. Ha ji otu ọnwa nọrọ n'aka ndị Boko Haram Otu ndekọ ndị UN nke e nyere ngalaba nchekwa ha kwuru etu ndị Boko Haram si enweta ego nakwa etu ego a na-ahụ anya nke kachasị na Naịjirịa si enyere ha aka nakwa etu ya bụ ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ha si kwalite ha. Mana cheta na oge a tọghapụrụ ụmụaka Dapchi ahụ bụ ndị a tọọrọ n'ọnwa Febụwarị afọ a, mịnịsịta a okwu mgbasaozi dịkwa n'aka bụ lai mohammed kwukwara oge ahụ na a gbapụara ụmụaka Dapchi ahụ na-akwụghị ihe ọbụla. Onye na-akpọ onwe ya Mama Boko Haram kwuru na onweghi ego gọọmenti Naịjirịa kwụrụ maka mgbapụta ụmụada ahụ.Na mkparịtaụka BBC Igbo na Mama Boko Haram nwere o kwuru na gọọmenti Naịjirịa akwụghị Boko Haram ego iji tọghapụ ụmụada Dapchi. Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo Mana otu nwantakịrị nwaanyị bụ leah Sharibu bụ naanị onye agbapụtaghị n'ime ha niile, ọ ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-53702862,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53702862,Ịta 'red meat' a dị gị mma n'ahụ? Lee ihe mere anyị ji ajụ,"Ịta anụ na-amasị ọtụtụ ndị Naijiria, mana ajụjụ dị mkpa bụ na ị na-atatara onwe gị nsogbu?","Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ka a na-ekwu na ọ dịghị mma ịta anụ, ọkachasị anụ nnama, mana ọ bụ eziokwu? Dịka ihe niile nọ n'ụwa, anụ ọkachasị nke a na-akpọ ""red meat"", nwere uru ma nwekwaa ọghọm. Ọghọm dị n'ịta anụ dịka ""red meat"": N'ihi na o nwejuru ihe ndị sayensị na-akpọ ""nitrate"" nakwa nnu na oke abụba kpụkọrọ ọnụ, ndị ọkammụta sayensị ekwuola na ọ dị mma iwebilata aka n'etu e si ata anụ a, ka ị nwee ike gbaara ọrịa na-eso oke ""cholesterol"" a ọsọ. Oke cholesterol n'ahụ mmadụ nwereike ibute nsuchi obi, nke nwereike ibute obi nkoropu maọbụ ọrịa obi ndị ọzọ. Kedụ ụdịrị anụ bụ ""red meat"" a? Ọ gụnyere: Mana ọ bụghị iwu na ị ga-agbachara ya ọsọ kpam kpam, n'ihi na ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na e nwere ụzọ ọ ga-abụ i were ya mezie anụ a, dịka ị na-ewebilata aka na ya, ọ dị mma oriri ma ghara itinye gị n'oke nsogbu. Uru dị n'ịta ""red meat"": Kedụkwanụ maka umeju anụ? Ịta umeju anụ nwekwara uru nwee ọghọm. Uru ya: Imeju anụ na-enye ahụ mmeem (iron), ma na-enyekwa Vaịtamin A. Vaịtamin A dịrị anya mma maka ịhụ ụzọ n'ime itiri, idozi ime ahụ mmadụ dịka imi nakwa inyere ahụ mmadụ aka n'ịlụso ọrịa ọgụ. Ahụ nwoke toro eto chọrọ ntakịrị gram 700, ebe nke nwaanyị chọrọ 600 kwa ụbọchị. Ọghọm dị na ya: Ọ dịghị mma ịta oke imeju anụ, n'ihi na ka ị na-eri ya ka vaịtamin A ahụ nwereike ị na-adọ gị n'ahụ ebe ọ dị ukwuu. Ahụ mmadụ na-adọkọ Vaịtamin A ọ na-ejighi rụọ ọrụ ruo ọdịniihu, bụ ebe ọ nwereike ibutere gị nsogbu mgbajisi ọkpụkpụ mgbe ị kawara nka. Ịta anụ ọ dị nwaanyị dị ime mma n'ahụ? Ị ga-atanwu anụ dịka nwaanyị dị ime, mana gbaa mbọ hụ na ị gbalahụrụ: Ọkammụta Tim Key nke Cancer Research UK, kwuru sị: ""Ọ bụghịkwa na ị ga-ekpebi na ị ga-akwụsị ịta anụ kpam kpam, mana ọ bụrụ na ị bụ ọta anụ, ị ga-etinye uche n'etu ị ga-esi webilatatu aka"". Etu ka mma isi emezi anụ ka ọ dị mma ọtịta Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na-edozi ahụ kwuru na ọ ka mma isi anụ esi ma ọ bụ mịa ya n'ọkụ na-etinyeghi ihe ọbụla, karịa ighe ya eghe, n'ihi na ighe ya eghe dị ka ịtụkwasị mmanụ n'elu abụba dị n'anụ. Ha kwukwara na ọ ka mma ịta anụ ọkụkọ maọbụ torotoro, mana ọ ga-aka mma ịdọpụ azụ anụ ahụ ya iji webilata abụba dọkọrọ n'ahụ ya, tupu i rie ya. Ha kwukwara na ọ ka mma ịta akụkụ ara ọkụkọ, ma gbaara anụ ndị dịka ""sausage"" nakwa nke a na-akpọ ""pate"" bụ anụ ahụ na-adị n'etiti achịcha burger ọsọ, n'ihi na ọ na-ebu oke nnu nakwa abụba. Anụ ""sausage"" na-ebu oke nnu na abụba" afirika-51400950,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400950,Justice for Chima: Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado,Ezinaụlọ Chima Ikwunado bụ nwoke a na-ekwu nwụrụ n'aka ndị uweojii na Pọtakọt ekwuola na ha na ndị uweojii ekpebibeghi ihe ọbụla.,"Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya Nke a na-abịa ka ndị mmadụ na-eche ihe ha na onyeisi ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Mustapha Dandaura, kpara. Obinna Ezirim bụ nwanne Chima gwara BBC na Dandaura kpọrọ ezinaụlọ ha oku ka ha kpaa dịka okwu na-efegharị na ndị uweojii kpọrọ ha oku ha ajụ ịza nakwa na ezinaụlọ ha kwuru na ha degara akwụkwọ na ha chọrọ ịhụ ya mana o nweghi isi. Ezinaụlọ Chima Ikwunado Obinna kwuru na ha na ndị uweojii kpebiri ịhụ ozu Chima nke ka dị n'aka ndị uweojii nakwa nke a ga-eme nyocha na Mọnde nke izu na-abịa. ""Kọmishọna uweojii sị anyị kpọta onye nnyocha nke anyị ụbọchị Mọnde, hanwa ga-akpọtakwa onye nke ha, e mezie nnyocha ahụ. ""Kọmishọna kwukwara na ọ di mma etu ezinaụlọ Chima si bịa, mana gọọmentị ga-elebarịrị anya na ya."" Ọrịa Coronavirus Dkt. Li tinyere foto ebe ọ nọ n'elu akwa na soshal midia Ọzọ bụ iwe ndị mmadụ na mba Chaịna maka etu ọrịa coronavirus si gbuo Li W bụ dọkịta bu ụzọ kwuputa maka ya na Disemba. Ọtụtụ n'ime ha na-asị ka gọọmentị rịọ mgbaghara maka iji ndị uweojii gbọchie Li ọnụ, nke mere ka ọrịa a bụrụ ibu na-anyị danda ugbua. N'egwuregwu, Raheem Sterling si Liverpool gafee Manchester City n'afọ 2015 Raheem Sterling nke Manchester City agaghị eso ha gbaa bọọlụ n'ime izuụka ole na ole na-abịa dịka ọ dọwachara akwara ụkwụ ya. Ebe Daley Blind ga-alọghachịta ma soro ndị Ajax gbaa bọọlụ n'ụbọchị Satọde, ka a chọpụtachara na o nwere ọrịa obi. 'Supreme Court' sị Jolly Nyame gaa zuo ike afọ 12 na nga Jolly Tavoro Nyame chịrị steeti Taraba na Naịjirịa site afọ 1999 ruo 2007 Ụlọikpe kachasị ekpebiela sị ka Jolly Nyame bụ aka chịburu Platu steeti ka nọrọ na mkpọrọ ruo afọ iri na abụọ a tụkpuburu ya. Ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission gbara ama mkpebi ụlọikpe n'akara Twitter ha. Ebubo EFCC boro Nyame bụ na aka ya dị n'otu ijeri naịra na ọma e mefuru n'aka Taraba steeti oge ọ na-achị steeti ahụ. Ndị ọkaiwu ise nke Mary Odili nọ n'isi ya, kachapụrụ nha ụlọikpe mkpegharị sị ka Nyame kwụọ. Ọ bụ n'afọ 2007 ka ikpe a malitere. Anyị arụghị ụlọekpere ndị alakụba - Gọọmentị Enugwu Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Enugwu steeti bụ Nnanyelugo Aroh ekwuola na o nweghi oge gọọmentị ha jiri hibe ụlọekpere maka ndị Alakụba. Maazị Aroh sị na ọ bụ ndị asịrị na-ekesa ya bụ akụkọ ma kwukwa na ọ bụ arụrụala kpatara ha ji akpa ụdịrị agwa ahụ. Ọ sị na akụkọ a bụ iji megide ọrụ gọọmentị Enugwu steeti na-arụ. Uzodinma so Buhari aga Njem Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga mba Etiopia taa bụ Febrụwarị 7 2020, maka ọgbakọ ndị mba Afịrịka na-aga n'ihu n'isiobodo mba ahụ bụ Adis Ababa. Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma ga-eso Buhari na njem ga-abụ mbụ o so ya aga kemgbe Ụlọikpe Ukwu nyere ya ọkwa gọvanọ Imo. Ị chọrọ ịza ogbu enyi? Ndị mmadụ na-ahụta enyi dịka eze ụmụanụ niile Mba Botswana na-enye ndị mmadụ ikike igbu enyi narị abụọ n'afọ 2020. Mana, ya bụ ikike abụghị n'efu dịka ọ bụ puku dọla iri na asatọ ka e ji enweta otu. A ahọpụtala ndị enwereike ịtụugo na AMVCA Ndị na-eme ejije n'Afịrịka na-ahazi onwe ha maka emume ntụrụugo akpọrọ African Magic Viewers Choice Awards. Ọtụtụ n'ime ha na-enwe nchekwube na ha ga-etụta ugo maka mbọ ha gbara n'ejije ihe nkiri dị iche iche n'afọ gara aga." egwuregwu-46585327,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46585327,"Premier League: Arsenal n'akwa, Chelsea na Liverpool n'ọchị","Ọtụtu ndị na-ele bọọlụ ọkachasị ndị na-ama aka nke Bekee kpọrọ ""Betting"", ga-agwa gị na asọmpi nke a gbara n'ụbọchị a bụ Disemba 16, 2018, agaghị etu ha tụwara anya.","A gbawara Arsenal na Manchester United obi, ebe Chelsea na Liverpool bu naanị ọchị si n'ogige egwuregwu laa. Danny Ings nke Southampton nyere goolu abụọ na nkeji 20 na 44 ebe Henrikh Mkhitaryan nke Arsenal sachara ha na nkeji 28 na 53 mere ka ha hara na goolu abụọ. Mana goolu Charlie Austin ji isi takpuo na neetị Bernd Leno, nyere Southampton goolu nke atọ mere ka mmeri a na-emeribeghi Arsenal n'ime egwuregwu iri abụọ na abụọ, bịa n'isi njedebe. Alex Iwobi bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Arsenal achịtaghị aja n'egwuregwu a mere e ji kpụrụ ya n'ọnụ ruo mgbe a gbachara. @SageGunner47 kwuru na ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na Arsenal rere Iwobi. @ReginaldOhiri kwuru na ọ maghị ihe Iwobi na-agba ga-eme ọ ga-eji eso bido egwuregwu. Ralph Hasenhuttl bụ onye nchịkọta otu Southampton mechara rịọ Unai Emery nke Arsenal arịrịọ maka ichefu ikwe ya n'aka dịka o kwesịrị ime na ngwụcha egwuregwu ahụ. Liverpool Liverpool mere Manchester United echeta ebewe ka ha zutere n'Anfield. Sadio Mané nyere goolu na nkeji 24, tupu Jesse Lingard nke Man Utd asaa ya na nkeji 33. Xherdan Shaqiri e tinyere n'egwu na nkeji 70 gbakara neetị na nkeji 73 na 80, nyere Liverpool mmeri kpọgoro ha n'elu tebulu Premier League. Chelsea Pedro bu ụzọ gbakaa neetị ndị Brighton ka Eden Hazard bunyere ya nri chinyere na nkeji 17. Na-erughi nkeji 17 ọzọ, ka a gbaruru bọọlụ na nkeji 33, Hazard n'onwe ya agbakaa neetị ndị Brighton. Ka a batara ọkara nke abụọ, Solly March agbakaa neetị Kepa Arrizabalaga, satara ndị Brighton otu goolu. Mmeri Chelsea meriri ha n'asọmpi a, mere ya ugboro abụọ ha ga-emeri ka ha zutere na Premier League n'afọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44903792,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44903792,Nigeria Air: Ụfọdụ ji ọdụ anya ele ya,Ọtụtụ ndị Naijiria na-adọrịta ụka banyere atụmatụ gọọmenti ikulite ụlọọrụ ụgbọeli Naijiria nwụrụ afọ 15 gara aga n'ọnwụ.,"Ụgbọelu ọhụrụ ga-ebido ọru na ọnwa Decemba nke 2018 Ebe ụfọdụ na-eto atụmatụ ahụ, ọtụtụ ji ọdụ anya ele ya na-ekwu na o nweghị mkpụrụ ụkwa gọọmentị ga-apịpụta n'ime ya. N'abali abụọ gara aga( abalị 18 nke ọnwa Julai,) gọọmenti etiti gbara ya n'anwụ na Naijiria ebidoghachila ụlọọrụ ụlọelu nke ala anyị nke a kpọrọ, 'Nigeria Air'. Otu onye so n'ọnụ na-ekwuru gọọmentị etiti bụ Tolu Ogunlesi kwuputara nke a n'igwe okwu Twitter ya. Ogunlesi kwuru na ọ ga-ebido ọrụ n'uju maka njem ụlọ na mba ofesi n'ọnwa Disemba. End of Twitter post, 1 Gọọmentị kwuru na ọ bụ iji gosi na naijiria ga-emenwu nnukwu ihe dị otu a. Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-akọta ụkwụ ije ọhụrụ a gọọmentị etiti na-azọpụ. Ha gbadoro ụkwụ na-ajụ sị na nwa mbụ bụ Nigerian Airways ejeghị ije, ọbụzị nke abụọ bụ Nigeria Air ga-agba ọsọ? @kesandu kwuru na akụkọ a bụkwa otu akụkọ mere na mbụ. Dịka o siri bo n'ebubo, Virgin Nigeria bidoro n'afo 2005 ruo 2009 ka ọchịchị onyeisiala oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo. Virgin Atlantic jikọtara aka were hiwe ya; Virgin were oke 45%, Nicon nke Jimoh Ibrahim nwe were oke 50%, ebe gọọmenti were 5% mana emecha ọ kpụọ afọ n'ala dịka ọchịchị gọọmenti ekweghị mezu nkwekọrịta ha binyere aka.. @DondenBeke chere ihe yiri nke @Kesandu: Ụfọdụ dịka@AdewaleOlukun na @Osike na-ajụ ajụjụ banyere imefu ego dị na ya. @Osike jụrụ ajụjụ sị, ọ bụrụ n'ezie na ọ bụ naanị oke 5% ka gọọmentị etiti nwe n'ụgbọelu a, gịnị mere na ọ bụ ha bụ mgbasaozi maka ya n'isi? Onye ọzọ bụ @ChikeMustafa na-ajụ ihe kpatara e jiri mefuo ụdịrị ego a maka pasentị ise mana mba Frans emefurughị ya na pasentị 31 oge ha tinyere ego na nke Virgin Atlantic. Taiwo Tobo kwuru na ebe emere akara njirimara ụgbọelu nke a kpọrọ 'logo' na bekee na mba Bahrain, buta ya na London. ""Efuntoye Olayemi dụrụ ọdụ sị, ""Ka anyị kwụsị iberibe igbado anya n'aha ụgbọelu a, tinye anya n'ọrụ ọ ga-arụ. Anyị aga agbado ụkwụ n'aha dịka ụgbọelu Turkish Air, Korean Air, Qatar Air, na ndị ọzọ."" Mana ọtụtụ dịka Oluyemi Fasipe na-ekwu na ọ bụ ihe dị ezi mma ka gọọmenti mere. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-55421109,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55421109,Merry Christmas: Kedụ etu Covid-19 siri metụta emume na ekele 'Merry Christmas nke afọ a?,Emume ekeresimesi nke afọ 2020 pụrụiche dịka ọrịa coronavirus na-echere mbaụwa niile aka mgba.,"Ọtụtụ ndị na-ekwu na ekele 'Merry Christmas' afọ a na-ara ha ahụ ikwe maka na ihe siiri ha ike. Ụfọdụ ụlọọrụ dịka Whatsapp gbalịrị iwepụta ihe a kpọrọ 'Emoji' maka ekeresimesi iji bulite obi ndị mmadụ. Ihe ọzọ kwa bụ na gọọmentị etinyela mmachi dị iche iche ọzọ iji hu na ha lụsoro ọrịa covid-19 ọgụ. Mana ọtụtụ ndị mmadụ kwechiri ma chọọ ụzọ ha ga-esi enwe aṅụrị ebe ụfọdụ kere nkwụcha were na-eme emume nke ha nwayọọ nwayọọ. Lee ka o si kwụrụ na steeti dị n'ọwụwanyanwụ. ABIA STATE Ahia Orie Ugba nke dị n'Ụmụahia Ahia orie ụgba nke dị n'Umuahia anaghị ekwo-ekwo dịka o si a dị na mbụ. Ahia anaghị aga etu ọ kwesịrị Ndị biara ahia Tomanto sitere N16,000 ruo N22,000 Ogechi Ogbuehi kwuru na ọrịa coronavirus tinyere azụmahia n'ọnọdụ ọjọọ nke mere ka ihe niile dị oke ọnụ. Ogechi Ogbuehi O kwukwara sị, "" ọrịa coronavirus mere ka ndị na-abịa azụ ahịa pee mpe nke ukwu"". Ogbuehi gwara BBC were sị ""na-agbanyeghị na ọ bụ oge a ka anyị ji ere ahịa nke ọma, mana afọ a gbara ọnyụpa"" - ANAMBRA STEETI Lee ka ahia Onitsha si ekwo ekwo Na-agbanyeghị na ọrịa coronavirus wakporo akụnụba ndị mmadụ na nke ọtụtu mba n'ụwa, ndị mmadụ juru n'ahị Main Market Onitsha. Anyị echeghị na ha ikpu mkpuchi imi ha maọbụ na ha na-erubere iwu nchekwa coronavirus isi. E nwere ndị na-achọ mma ekeresimesi na-agbanyeghị covid-19? ""Anyị anaghị ere ahịa dịka anyị si ere na mbụ maka Covid-19"" - Kizito Okoye Mazị Kizito Okoye bụ onyeisi ụlọọrụ ịchọ ma nke dị na Ọka Anambra steeti gwara BBC na covid-19 metụtara azumahia ya. Okoye kọwara na ọ bụ onye rijuru afọ na-abịa achọ mma. Ndi na-achọ mma mbọ aka O kwuru na ndị na-abịa maka ihe ịchọ mma dị iche iche perempe n'afọ a karịa afọ ndị ọzọ. Ọ kọwara. "" Ngwa ọrụ anyị ji arụ ọrụ dịzị ndala ọnụ, nke a metụtara ego ndị mmadụ na-akwụ anyị"". EBONYI STEETI Onye ntaakụkọ anyị mere ngagharị na isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakiliki were gosi etu ndị Ebonyi steeti sị akwado emume ekeresimesi. Gọọmentị Ebonyui steeti na ndị ọchịchị na steeti ahụ gbalịrị iji ihe onyonyo ekele ndị nke ha maka emume ekresimesi. Ndị mmadụ na-emekwa njem dịka ha si eme na mbụ, enweghị ebe na-ekwo ekwo dịka anyị siri tụọ anya. Ihe ndị na-azụ ahịa nwere ikwụ Ahia tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ anaghị abịa azụ ahịa dịka ha sị azụ na mbụ n'oge ekeresimesi. Onye bi n'Ebonyi steeti bụ Jeremiah Okom gwara BBCIgbo na ọrịa covid-19 metụtara ya n'ụzọ dị njọ. O kwuru na ọ bụghị etu esi azụ ahịa ya n'afọ gara aga ka esi azụ ya n'afọ a. N'aka nke ọzọ, Daniel Eze bụ onye na-ere akụrụngwa dị iche iche eji eme emume ekeresimesi n'ụzọ owe kwuru na ahịa ha na-aga nke ọma. O kwuru na ahịa ha na-aga ọfụma na-agbanyeghị covid-19 na ngaghariiwe Endsars mere n'afọ 2020 a. ""A na m ere ahịa nke ọma"" - Daniel Eze Eze kwuru sị "" Amaghị m maka ahịa ndị ọzọ mana anyị na-ere akụrụngwa ekeresimesi na-ere ahịa kamgbe ihe dịka ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba"". Akụkọ ka na-abịa" afirika-46673110,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46673110,Zamfara Killings: Ndi mmadụ abaala okporoụzọ n'obodo Tsafe igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ,Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ.,"Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu ""anyị achọghị"". Content is not available End of Facebook post, 1 Onye ntaakụkọ BBC Hausa gwara BBC Igbo na ọ bụ maka ahụghị enyemaka gọọmenti banyere ọtụtụ mmadụ gbara ọsọndụ bata Tsafe, bụ iwe ndị a na-eme ngagharịiwe. N'ụbọchị Satọde gara aga, bụ Disemba 22, 2018, mmadụ 16 nwụrụ n'obodo Magamin Diddi dị n'okpuru ọchịchị Muradun. Aka na-achị Tsafe bụ Aliyu Abubakar Tsafe, gwara BBC na Satọde ahụ mere ya abalị atọ ndị omekome a na-abịa obodo Asaula, nke mere ndị mmadụ ji gbaa ọsọndụ. Ọ bụ iwe ogbugbu mmadụ a mere ndị mmadu jiri na-eme ngagharịiwe. Ugbua ndị uweojii na ndị agha agaala obodo ahụ iji hụ na a kwụsịrị ngagharịiwe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43283758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43283758,Ebugharịala ikpe Eni na Shell nwere n'Italy maka Naịjirịa,"Kama Eni na Shell ga-azara ọnụ ha gbasara ebubo eboro ha maka inye akaazụ na nrụrụaka maka ala mmanụ agbịdị ha zụrụ na Naịjirịa taa n'ụlọikpe dị na Milan, Italy, ebugharịala ụbọchị mgbaraonwe ha.","Akụkọ na-akọwa na nke a nwere ike ịbụ ikpe mpụ na nrụrụaka dị n'etiti ndị mmanụ agbịdị a ga-akacha ekwu maka ya Otu onye ọkaikpe na Milan kwuru na-ebugala ikpe ha ụbọchị 14 nke ọnwa Mee maka na ha nwere ọtụtụ ikpe ha ga-ekpe, nke mere na a ga-ebuga ya ụlọikpe ọzọ dịkwa na Milan iji kwụsị igbu ya oge ọzọ. Onyeisi ndị Eni bụ Claudio Descalzi na Paolo Scaroni bụ onye ọ nọchiri anya ya na ndị ọrụ si Eni na Shell, so na ndị ga-azara ọnụ ha n'ihu okaiwu. Dan Etete bụbụ minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa ga-esokwa zara ọnụ ya. Eni - ndị ebokwara ebubo nrụrụaka na mba Algeria - na Shell ga-agba mbọ ịgbara isi onwe ha ka-ebochara ha ebubo inye akaazụ oge ha zụrụ ala mmanụ agbịdị akpọrọ OPL245 na 20111, nke a na-ele anya n'onwere udu mmanụ agbịdị ijeri itoolu, ka ha kwụchara dọla otu ijeri na nde narị atọ ji zụta. Otu abụọ a agọrọla aka ha n'ime ebubo ndị a eboro ha. ""Obi kara Eni n'ime ngalaba ikpe marakwa n'ikpe a ga-ezi ezi ma gosikwa eziokwu na iguzosi ike n'ezi ihe gbasara omume ha,"" ka Eni kwuru n'ihe ndepụta ha wepụtara. Akụkọ si n'aka ndị Global Witness bụ mpaghara na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka, kwuru na nkwekọrịta dị n'etiti ndị otu a na onyeisiala chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan na Etete bụbụ minista ya, gosiri na ha nara akaazụ. Eni kwuru sị: ""Eni na Shell na gọọmentị etiti mere nkwekọrịta ha n'akpọghị onyeọzọ aha. Etinyere ego ha natara n'ime otu akpa gọọmentị etiti Naịjirịa nwere,"" Ikpe a na-ekwu maka ya Descalzi kwuru n'afọ gara aga na Shell na Eni etinyeghị ọnụ ""n'ime etu gọọmentị si kpebie ike ego ahụ."" Shell kwuru na ha kwere na ndị ọkaikpe ga-ekwubi n'onweghị ikpe ga-emedgide ha, kwuokwa ""inye akaazụ na nrụrụaka enweghị ohere n'otu anyị"". Naịja Delta bụ ebe a na-emepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa Mmekọrịta Shell na gọomentị Naịjirịa nwere na 2011 kwesịrị ịkwụsị ikpe ọgụ afọ ha na Malabu bụ otu mmanụ agbịdị nke Dan Etete nwere gbasara ala mmanụ OPL245. Etete wụbụ minista oge Sani Abacha chịrị, kwadoro ala mmanụ ahụ n'afọ 1998, ma resị ya Malabu bụ otu emechara chọpụta na ọ bụ ya nwe. Gọọmentị mechara napụ ya ikike gosiri na ọ bụ ya nwe ya, nye ya Shell ma nyeghachịkwa ya Malabu, nke mere e ji gbaa ha akwụkwọ." afirika-47376125,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47376125,Presidential Election 2019: APC na PDP na-arụ onwe ha aka n'ọnụ banyere ntuliaka 2019,Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole na mgbasaozi e wepụtara asaala Atiku Abubakar ebubo niile o mere gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala.,"APC na PDP na-asagharị onwe ha okwu banyere onye mere wuruwuru na ntuliaka ọkwa onyeisiala Oshiomhole kwuru n' ozi ọ gbasara n'Abuja ụbọchị Tọzde na mpụtara ntuliaka bụ nke igwe 'Card Reader' wepụtara, na ọ bụghị nke ndị mmadụ ji aka ha depụta ka o si sọ ha. O kwuru na ndị mmadụ gbara mbọ ịdenye aha ha oge karịrị otu mgbe mana o nweghi isi. Ọ mara atụ kwuo na o nwere ndị mmadụ ejidere ebe ha ji PVC ruru otu nde. O kwuru na ọ bụrụ na Atiku nyocha APC na PDP ọ ga ahụ na ihe dị iche dị. Ọ dọrọ APC aka na ntị ka ha ghara iji aka ha jiri kpaa ike na Satode gara aga soro ntuliaka ọkwa gọvanọ nke na-abịa n'izu ọzọ. Lee ihe niile o kwuru ebe a Ngwa ngwa APC mechara mgbasa ozi nke ha site n'ọnụ Adams Oshiomhole,, PDP sochiri ha site na ịsaghari n'ọnụ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbodiyan. odeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Kola Ologbodiyan PDP boro ebubo na e jiri ndị agha were yie ndị mmadụ egwu ma mee wuruwuru na steeti ndị PDP gbanyere mgbọrọgwụ dịka Bayelsa steeti, Rivers na Akwa-Ibom. Ologbodiyan boro ebubo na Rotimi Amaechi ji ndị agha gbanwee mpụtara Rivas steeti. O bokwara Godwill Akpabio ebubo ideghari mpụtara ntuliaka n'Akwa-Ibom. Kirie ihe Ologbodiyan. kwuru n'uju ebe: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52788020,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52788020,Coronavirus in Nigeria: 'Ọ bụghị coronavirus gburu Kọmịshọna Mbara Ezi' - Gọọmentị Abia steeti,Kọmịshọna maka mgbasa ozi nke Abia steeti bụ John Okiyi ekwuola na Kọmịshọna na-ahu maka mbara ezi n'Abia steeti bụ Solomon Ogunji anwụọla.,"O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị satụde nke iri abụọ na atọ nke ọnwa Mee ka ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ mahadum Abia steeti. Solomon Ogunji rụkwara ọrụ dịka onyeisioche ngalaba gọọmentị Abia steeti hiwere maka ọrịa coronavirus. N'otu aka ahụ, onyeisi odee akwụkwọ nke Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kọwara na ọbụghị coronavirus gburu ya kama na ọ bụ site n'ọrịa ọbara mgbalị ka o siri nwụo. Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu natara ya bụ ozi n'obi nnwute dịka ọ bụ nanị n'ụbọchị Wenesde ka Ikpeazu na Ogunji nwere nzụkọ. Ikpeazu e zịgarala ndị ezinụlo ya ozi iti aka n'obi. A na-eke onye enyemaka Boris Johnson nnukwu ọkpọ ugbua ka o rituo n'okwa Onye ụlọomeiwu ""conservative"" nke mba UK akpọọla oku ka onye enyemaka Boris Johnson rituo n'ọkwa ya. Steve Baker kwuru ka David Cummings rituo makana ọ gara njem mgbe mba ahụ a machịrị ngagharị maka covid 19 na Uk. Ka Baker kwuchara nke a n'ihe ngosi BBC, ndị otu ya dịka Simon Hoare nakwa Damian Collins tinyere ọnụ kwuo ka Cummings kwakọrọ lawa makana ọ chịpụtala ụkwụ gọọmenti mba Uk n'ezi. Kedụ mgbe nsogbu Cummings malitere? N'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Maachi ka ozi pụtara na Downing na Boris Jonhson nakwa minista na-ahụ maka ahụike nke Uk butere coronavirus. A hụrụ ebe mgbe cummings si n'ụlọ praim minista Uk agbapụta ụbọchị ahụ. N'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Maachi, ozi pụtakwara ebe ahụ na Cumming dopuru onwe ya n'ụlọ ya ka o bidoro hụwa ihe gosiri na o bu coronavirus. Cumming na ndị bee ya gụnyere nwunye and na nwa ya gara njem site na Lonmdon ruo na Durham ị ga-anọ ndopu ha. A mabeghị ụbọchị bụ ihe ahụ. Ụlọọrụ na-agụkọ ndị batara na mba ha na Durham kwtere na Cumming batara n'ụbọchị Maachi iri atọ na otu. Kedụ iwu coronavirus Cummings dara? Mgbe Cumming mere njem ahụ, UK niile nọ mmachị ngagharị nke gụnyere ihe ndị a. ·Ị ga-apụ ga-azụtanwu naanị ọgwụ na nri ·Ị ga-aganwu ga mee mmegharị ahụ naanị gị maọbụ gị na ụfọdụ ndị bee gị. ·Ị ga-apụli ga-anata ọgwụgwọ ·Ị ga-apụlị maka ọrụ dị oke mkpa . ị gaghị aganwu bee ọyị maọbụ ụmụnne gị maọbụrụ na ihu ihe ọbụla gosiri na i bu coronavirus. . Ị ga-edopu onwe gị ruo abali iri na anọ ma ihu ihe gosiri na ibu ọrịa covid. Gịnị ka Cummings kwuru maka ya bụ atụmmatụ? O kwuru na onweghị ihe ọjọ o mere nke o ji enwe iwu ọ dara. Gọọmenti mba Uk e kwuru gịnị? Ha kwuru na Cumming gara ebe dị nso na bee ha dopu onwe ha makana ya na nwunye ya chọrọ idowe nwa ha ebe ọ ga-anata nchekwa zuru oke. Aka na-achị mba Israel bụ Benjamin Netanyahu ga-azara ọnụ ya n'ụlọ ikpe taa bụ ụbọchị sọnde iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee. Nke a bụ mbụ onye nọ n'ọkwa ga-aga ụlọikpe na mba ahụ. E boro Netanyahu ebubo mpụ, ịna aka azụ, nakwa imebi okwukwe e tinyere na ya dịka onyeisiala. ọ ganahụrụ ebubo ndị a niile. Netanyahụ dị afọ iri asaa ajụla iritu n'ọkwa dịka ndị na-ama ya aka na-ekwusi ike ka o rituo n'ọkwa ya wee ga zaragodu ọnụ ya n'ụlọikpe. Ebubo ndị a na-abịa dịka Netanyahu werechara oche dịka onyeisi gọọmenti chịkọtara ndị mba ahụ, a na-enwebeghị ka mgbe. Onye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Benny Gantz ya na ya na-ama aka kwetere ikesa ikike ọchịchị kamgbe mpụtara ntụliaka atọ n'otu afọ edochaghị ndị mmadụ anya ọfụma. Netanyahu ga-azara ọnụ ya na ""Jerusalem District Court."" Cheta na ọ bụ praim mịnista kacha nọ n'oche ọchịchị karịa ndị chiburala mba ahụ dịka ọ malitere chịwa Israel kamgbe afọ 2009. Kedụ udiri nrụrụaka a na-ebo Netanyahu? E kere ebubo a ụzọ atọ kpọ ha 1000, 2000, 4000. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49676984,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49676984,Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara,"Ichekwa ego na kom-kom, okpuru akwa maọbụ n'ụlọakụ maka echi dị mma, mana itinye ego n'ebe ọ ga-amụtara gị ihe kacha mma.","Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara Ihe nke a jị dị mkpa bụ maka na mbuli ọnụahịa (inflation) na-eme ka uru ego gị gbadaa ma ọ bụrụ n'ị hapụ itinye ya n'ọrụ nke na ihe ọ zụtanwuru n'afọ a, ọ gaghị azụtanwu ya n'afọ ọzọ. Ọmụmaatụ: N'afọ 2015, otu akpa osikapa na-ada puku naira 12 mana n'afọ 2019, onye dowere puku naira iri abụọ na kom-kom n'afọ 2015 agaghị eji ya zulie otu akpa osikapa dịka ọnụahịa ya kwụzị naira puku 17. Dịka NBS siri kwụọ, mbuli ọnụahịa dị pasent 9.02 n'afọ 2015 mana ọ gbaliri rue pasent 11.08 n'afọ 2019. Na nkọwa ya, onye ọkachamara n'ihe gbasara nhazi ego onye bụ Uche Iheanacho rụtụrụ aka n'ebe asaa mmadụ nwereike itinye ego o chekwatara ka ọ mịtara ya ezi mkpụrụ. Ha gụnyere: 1. Iji ego achụ ego maọbụ ịgbakwụnye ihe ọzọna abụghị isi ọrụ gị na-ewetara gị ego Ị na-arụ ọrụ Bekee ma ị na-azụ ahịa, i nwereike izipụ ego gị ka ọ na-agara gị ozi ịchụ nta ego. Ihe dịka itinye ego n'ịgba 'Keke', ụgbọala maọbụ ọkada, ire ahịa maọbụ ịtụbata ahịa so na ihe i nwereike ime ego i dokwara ana-agbalite. 2. 'Treasury Bill' Nke a bụ akwụkwọ ego gọọmenti na-azụ n'aka ọha ọnwa issi maọbụ otu afọ iji nweta ego ha ji arụ ọrụ. 3. Bond Nke dịkwa ka 'treasury bill' mana ọ na-ewe ọtụtụ afọ bido afọ abụọ maọbụ iri abụọ. 4. 'Fixed deposit' Nke a bụ itinye ego gị n'ụlọakụ ọnwa atọ, isii maọbụ otu afọ maọbụ oge ole gị na ụlọakụ kwekọrịtara, na akpaghị ya aka maọlị. Uru dị ya bụ na ọ ga-amụtara gị nwa karịa ego ichekwara n'ụlọakụ nke ị na-adobiri oge ọbụla ọ masịị gị. 5. Itinye ego n'ego mba ndị ọzọ(Forex) Itinye ego n'ego igwe dịka paụnds maọbụ dọla ga-echekwa ego gị ọ gaghị ada rue ka ego gị ma ọ bụrụ na ị hapụrụ ya n'ụlọ maọbụ n'ụlọakụ. 6. Ịzụ ala maọbụ ụlọ I nwere ike iji nde naira ise(N5m) rụta ụlọ ala dị mma Igba ala bụ ezigbo ebe i weere ike iji gị a bara gị ezigbo uru. 7. Itinye ego na ịkwalite nka gị (personal development) Ịgakwu akwụkwọ maọbụ ọmụmụ ga-enye gị ohere ịmụta nka maọbụ iwelite amamihe n'ihe nke ị ma na-eme maọbụ ọrụ ị na-arụ ga-eme ka ị na-enweta karịa ihe ị na-enwetabu na mbụ. Gee ya n'ụju n'ihe onyonyo dị n'elu: Akụkọ ga-amasị gị Davido egechiela Chioma! Foto ndị si na mkwanye ugwu ikpeazụ Robert Mugabe" afirika-43787106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43787106,Ndị uweojii na ndị okpukpe Shiite na-ama aka n'Abuja,Akụkọ kwuru na otu onye anwụọla dịka ndị uweojii na ndị Shiite na-eme ngagharị iwe kwatara na Mọnde.,"Ndị Shiite na-eme ngagharị iwe n'Abuja Ndị uweojii ji gasị anya mmiri na-achụpụ ndị mmadụ ndị na-eme ngagharị iwe na Unity Fountain dị n'akụkụ Transcorp n'Abuja. A na-ele anya na ndị ahụ na-eme ngagharị iwe bụ ndị okpukpe Shiite na-achọ ka akpọpụtaz onyeisi ha bụ Ibrahim EL-Zakzaky bụ onye e ji kamgbe afọ abụọ. Nke a na-abị dịka ndị uweojii kwuru na ha akagbuola ngagharị iwe niile ma nke bụ nke udo ma nke ndị na-abụghị nke udo n'akụkụ Unity Fountain dị n'Abuja. Ndị ọnụ na-eru n'okwu katọkwara ihe ahụ ndị uwe ojii mere. N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa n'igwe Twitter ekwupụtala etu obi dị ha na ya bụ ngagharị iwe. Onye a kpọrọ Mr Aye Dee na twitter kwuru na ebe ọ bụ na ihe onyonyo pụtara gosiri na ndị Shiite ji okwute na-atụ ndị uweojii, ọ pụtara na ngagharị ha abụghị nke udo. N'akụkụ nke ya, Kamal Abubakar kwuru ka ndị Shiite jiri nwayọ na-eme ngagharị ha n'udo ka ha nwe ike inweta ezigbo ọsịsa karịa iti ha ihe maọbụ e gbuo ha man̄ọbụ ha agaa nga. Okafor Stanley kwuru na ya hụrụ ka ndị Shiite mebiri ọtụtụ ụgbọala ndị mmadụ oge ha na-eme ngagharị, o kwuru na ya anaghị emeziri ha ebere ọbụla. Ndị agha Naịjirịa kpụrụ onyeisi ndị Shiite na Kaduna n'afọ 2015 dịka ndị otu ha na ndị agha Naịjirịa nwere ịma aka n'ihu nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ. Ndị agha kwuru na ndi otu Shiite chọrọ igbu onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai ebe ha gbochiri ụzọ ụgbọala Buratai na-agafe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46428640,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46428640,"Nigeria Election 2019: Mbaka, Oyedepo na ụkọchukwu ndị ọzọ okwu ha na-adị ire",Ọtụtụ oge ka a na-ahụ ndị na-azọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha na-aga n'ụlọụka dị iche iche ma oge ntuliaka ruwe nso.,"Ebe ụfọdụ ndị na-ahụta ya ka amansị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme makana ha ma ụdịrị ikike ndị ụka nwere na ndụ ndị Naịjirịa, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ahụta ya dịka na ha chọrọ ""ịnata ngọzị"". Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na-anọ n'elu ebe ha na-aka ụka, ma na-ebukwa amụma maka ihe ga-eme na ntụliaka maọbụ n'ọchịchị Naịjirịa. Ụfọdụ oge, ọ dabara ndị nọ n'ọchịchị, ụfọdụ oge amụma ahụ agaghị adaba, ọ kpọtụwa. Ndị ụkọchukwu na-akpa ike: 1) Fada Ejike Mbaka Mbaka bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo sị wụlie elu, ndị ụka ya bụ Adoration Ministry Enugu, ajụọ ya, ""kedụ ebe ị chọrọ ka anyị wụruo?"" Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ma nke a, ya mere ha na-eji akpọku ya, maọbụ agara ya njem nleta n'ụlọụka ya, ebe ha ga-ezute ndị ""ụmụazụ"" ya n'ihu n'ihu. Kwa ntuliaka, Mbaka na-ebu amụma onye ga-enweta mmeri na ntuliaka na onye enweghị ebe o ji azụ aga. N' afọ 2015, Mbaka buru amụma na Goodluck Jonathan agaghị emeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ ahụ n'ihi na Chineke ajụla ya, kama na Muhammadu Buhari ga-enweta mmeri. Amụma ya ahụ adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma ọkachasị Ndigbo n'ihi ịhụnanya ha nwere n'ebe Jonathan nọ, mana Buhari mechara merie. Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 N'ọnwa Julaị 2018, Mbaka wụgharịrị kwuo na ọchịchị Buhari bụ 'Demon-cracy', na ọ bụghị Democracy . Ọmụmatụ ọzọ gosiri ụdị ike o nwere na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ oge Hope Uzodimma nọchitere anya onyeisiala Buhari ka Mbaka na-eme ire ahịa owuwe ihe ubi (Bazaar) n'ọnwa Disemba. Uzodimma kwuru na Buhari nyere ya nde naịra abụọ ka o jiri ""waa ọjị"" n'emume ahụ, ma kwekwa nkwa iwuru ụka ahụ ụlọọgwụ nke ha. N'otu emume ahụ, o kwukwara na Atiku ịbụ onyeisiala nwere ike ịbụ ọnọdụ ""ire enwe gote nkịta"". 2) David Oyedepo Ọ bụrụ na ị maghị Oyedepo maka inwe otu n'ime ụlọụka kachasị nwee ndị na-aga ya na Naịjirịa,Living Faith Church, nke e ji 'Winners Chapel' mara, ị mara ya maka ugboro ole ọ na-emeta ihe e ji akpụ ya n'ọnụ. Maka etu ụlọụka ya ha, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa njem nleta ebe ahụ, ọkachasị ma oge ntuliaka na-eru. Ndị dịka Goodluck Jonathan bụ aka chịburu Naịjirịa, Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa Kingsley Moghalu, so na ndị ndọrọndọrọ zuterela Oyedepo. Ọtụtụ ndị bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, bụ ndị na-aka ụka n'ụlọụka ya. Na Nso nso a, Oyedepo kpalitere okwu na soshal midia oge o tinyere ọnụ n'okwu gbasara ma ọ bụ ""ezigbo"" Buhari nọ n'Aso Rock ka ọ bụ ""adigboroja"". 3) Enoch A. Adeboye Adeboye bụ onyeisi Redeemed Christian Church of God (RCCG), so na ndị ọzọ okwu ha na-ada ụda na Naịjirịa ma n'ụka ma na ndọrọndọrọ ọchịchị. N'agbanyeghị na ọ bụ nwoke na-anaghị emesi ike (ọ na-ekwu okwu nwayọ nwayọ), o kwuo okwu, a na-akwụsị gee ya ntị. Yemi Osinbajo bụ osote onyeisiala Naịjirịa ugbua, bụ onye ụkọchukwu n'ụlọụka a; e nwekwara ọtụtụ ndị ụkọchukwu ha ndị ọzọ nọ na ndọrọndọrọ ọchịchị. Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan nakwa Olusegun Obasanjo, so na ndị na-abịa eleta Adeboye n'ụlọụka ya. O zutekwara Buhari na London oge ahụ adịghị ya. 4) TB Joshua Joshua bụ onye ụkọchukwu ọzọ ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị eji egwu egwu, ọkachasị makana ha kwenyere na amụma ya na-abịakarị na mmezu. Kwa afọ ka ọ na-ebu amụma metụtara ọchịchị Naịjirịa nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, n'ụlọụka ya bụ Synagogue Church of All Nations (SCOAN). N'ọnwa Julaị nke 2018, Joshua buru amụma ebe o kwuru ka ""ndị mmadụ kpeere Naịjirịa ekpere maka ntuliaka na-abịa"", makana ọ rọrọ nrọ ugboro ugboro maka ""ihe ndapụta nwere ike ịdapụta n'usoro ntuliaka 2019"". N'ọnwa Ọktoba 2018, Buhari kwuru na ndị ụka ekwesịghị itinye ọnụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, makana o nwere ike ibutere ha mkparị. 5) Mathew kukah Kukah bụ ụkọchukwu Sokoto Catholic Diocese, bụ otu onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa. O so na ndị ụkọchukwu zuterela onyeisiala Buhari; o zutere ya na 2015. N'ọnwa Epreelụ 2018, Kukah kpọkuru Buhari sị ya gbaa mbọ hụ na o mezuru nkwa niile o kwere tupu ọ bụrụ onyeisiala. 6) Tunde Bakare Bakare bụ ụkọchukwu ụka a kpọrọ Latter Rain Assembly, abụghị sọ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, o sorola zọọ ọkwa ọchịchị. N'afọ 2011, Buhari kpọorọ ya zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati CPC, nke Bakare zọrọ dịka osote ya, mana ha emerighị. 7) Poju Oyemade Oyemade bụ ụkọchukwu Covenant Christian Centre, ebe ọ na-anọ ahazi nrụrịtaụka gbasara ntuliaka nke Bekee kpọrọ ""election debate"" n'etiti ndị na-azọ ọchịchị, ma ntuliaka ruo. Ọ na-akpọ nrụrịtaụka a ""The Platform"". Ụkọchukwu ndị ọzọ ọnụ ha na-eru n'okwu ndọrọndọrọ" 42884089,https://www.bbc.com/igbo/42884089,Atụọla Ogbunigwe n'ụlọ onye bụbụ osote onyeisiala Kenya,Ndị uweojii na mba Kenya kwuru na ngalaba ha na-ahụ maka ihe gbasara ogbunigwe awuchiela n'ụlọ onye bụbu osote onyeisiala Kenya bụ Kalonzo Musyoka dịka ndị omekome wakporo be ya tụa ogbunigwe ma gba egbe na ọnu ọzọ be ya.,"Ndị gọọmentị Kenya wepụru ndị nche ha nyere Kalonzo Musyoka so na ndị otu pati na anọghị n'ochichi a na-akpọ Nasa (National Super Alliance). Ihe a mere n'elekere abụọ nke ụtụtụ taa bụ Wenezde. Ndị uweojii na akọwa na onyeghị onye meruru ahụ maọbụ nwụọ na ihe a mere, agbanyeghi na Kalonzo nọ n'ulọ. Onye enyemeaka Kalonzo a kpọrọ Matiki na-akọwa na ndị kpara ike a ji ụgbọala bia, mana ha gbafere mgbe ha hụrụ na ndị nche nọ ọrụ n'ụlọ ahu. ""Ha tụghariri ka ha gbafere, kwụsị n'ọnụụzọ wee tụọ ogbunigwe ma bido igba egbe,"" ka Matiki siri kwuo. Ogbuniwe ahụ ha tụrụ danyere na mgbidi wee dapụ n'okporo ụzọ tupu ọ gbaa. Matiki sị na ndị mwakpo a gbara ọsọ ka ha kpachara ike a, ma kwukwa na ọ bụ ogbubu ka ha bịara igbu Kalonzo. Ọ si na ha kpotere mgbọ egbe na ntu ogbunigwe ahụ iji gosi na mwakpo a mere. Ndị uweojii gbajere ebe ihe a mere ka ha nwetere ozi. Cunningham Suiyanka, bu onyeisi ndị uweojii na ebe ihe a mere si na ha ebidola nchọpụta. Odinga akpọla onwe ya ""onye ọchịchị nke ndị mmadụ"" Kenya nọ na ọgbaaghara ugbua ka onye so we zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 bụ Raila Odinga chere onwe ya iyi ọrụ dịka ""onyeisiala"". Kalonzo agaghị ebe Odinga mere mmeme iṅụ iyi a, mana tupu nke a eme, gọọmenti etiti mba Kenya wepụrụ ndị nche o nweburu dịka osote onyeisiala mba Kenya. Kalonzo kwesiri ịnụ iyi ka osote Odinga." afirika-49679596,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49679596,Davido nọ na njem ịgba ọgọ n'ikwu nne ya site n'ịlụta Chioma,"Ma iji ya gụọ egwu, ma ịsị na ọ bụ ọpụrụiche n'etiti ụmụnwaanyị niile no ya n'akụkụ, David Adeleke bụ onye eji Davido mara egosila ụwa na ya hụrụ nwaada Chioma Raymond n'anya.","Nke a mere onweghi onye ọtụrụ n'anya mgbe asi na asị malitere ịpụta na ọ gara njem ịkụ aka n'ụzọ n'obi ndị nwe Chioma n'izu ụka gara aga. Mana, ya bụrụ na ị so ndị na-agwa ọnụ na oti egwu a ama ama nọ njem alụmdị na nwunye ya na Chioma, o suru okwu ahụ kpọm ụnyaahụ mgbe ọ gburu ikpere n'ala ji mmgba aka gechie ya. Nke a mere n'obodo Eliza bụkwa mbu ndị mmadu na-ahụ n'anya na ya bụ nwaada rijuru afọ. Davido dere n'akara Instagram ya na Chioma kwenyere na ha abụo ga-amalite ezinaụlọ dịka di na nwunye. Chioma na onwe ya ji ""A hụrụ m gi n'anya"" gbasa ozi atumatụ a. Cheta na foto Chioma tinyere n'akara Instagram ya n'izu ụka gara mere ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na Davido gara ịkụ aka n'ụzọ dịka omenala Igbo siri kwuo. Na soshal midia ndị mmadụ na-eti mbada mkpu maka atụmatụ a. Davido deburu na Twitter na agbamnkwụ ga-eme n'ime afọ 2020. Ka ọ kwụ ugbua, Davido nọzị njem ime ka nna ya ochie site na-ịga n'ikwu nne ya ochie bu ala Igbo ga lụta nwaanyi. Mana, onwekwara ndi na-aju ma a na-akụ aka n'ụzọ tupu ajụọ nwaanyị ka ọ ga-alụ n'agba ọhụrụ?" afirika-49766628,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49766628,Abịa Gọvernorship Election: Ikpeazu emeriela Otti n'ụlọikpe ntuliaka,Alex Otti bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Abịa steeti n'aha otu Apga ekwuola na ya anabataghị mkpebi ụlọikpe ntuliaka kpebiri n'ụbọchị Friade.,"Ụlọikpe ntuliaka nọrọ n'ụmụahịa were kụpụ akwụkwọ nke Alex Otti gbara iji gbagha mmeri Okezie Ikpeazu Nke PDP meriri na ntuliaka e mere na abali itoolu nke ọnwa Maach na steeti ahụ. Jọstis Lekan Ogumonye onye bụ onyeisi ụlọikpe ahụ kụpụrụ arịrịọ niile Otti rịrọ ma kwuo na o gosighị ihe akaebe doro anya na ebubo ndị o boro bụ eziokwu. Mana Otti si na mkpebi ahụ adabaghị. Otti onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Kazie Uko gwara BBC sị ""A nabataghị mkpebi ahụ."" ""Ndị ọkaiwu anyị na-atụle akwụkwọ mkpebi ahụ tupu e kpebie ihe ga-eme."" Mgbanwe ihu igwe na-aka njọ Ọtụtụ ndị na-agba mbọ maka nchekwa gburugburu emeela ngagharịiwe na legos, Abuja na Pọtakọt ụbọchị Fraide maka mgbanwe ihu igwe nke Bekee kpọrọ ""Climate Change. Ha tụrụ arịrị na oke idemmiri na-agba ike n'ebe dị iche iche na Naijiria so na nsogbu mgbanwe ihu igwe na-ebute. Na mba ofesi, A chọtala Peter Magombeyi bụ onyeisi otu ndị dọkịta na mba Zimbabwe nke e chere na a tọrọ na Satọde gara aga Mana gọọmentị mba ahụ na-ekwu na ntọ ya na nchọta ya dịka ihe a kpara akpa. N'egwuregwu, Otu AC Milan ehiwela otu ga-ahụ na ndị mmadụ ag aghị akpa oke agbụrụ n'asọmpị ha ga-agba na ngwụcha izuụka a. Onyeisi otu ahụ bụ Ivan Gazidis sị na o kwetara na otu ya kwesiri ịtịnye ọnụ ma gbanwee echiche ndị mmadụ gbasara ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu bọọlụ Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Onyeisiala Buhari ga-apụ gawa ọgbakọ United Nations Buharị ga-aga ọgbako UN n'ụbochi Sunde Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ga-ahapụ Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde gawa ọgbakọ United Nations nke iri asaa na anọ na New York, mba Amerịka. Buhari ga-abụ onye nke ise ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a. Cheta na e mere nwaafọ Naịjirịa bụ Tijani Muhammad-Bande onyeisioche ọgbakọ a n'onwa June 2019. N'aka nke ọzọ Ministrị na-ahụ maka mmiri ga-eme ihe ngosị gbasara idebe onwe na ezi ọcha Nke a na-atụ anya ga-eme ka ndị mba ọzo agbatara Naijirịa ọsọ enyemaka i ji kwụsị i ga mposị n'ezi. Aka akparala onye e che na-egbu ụmụnwaanyị na Pọtakọt anuchiela mmadụ atọ ọzọ tupu ejide nwoke a Ndị uweojii egosila otu nwoke ha sị na ha che n'aka ya dị na ogbugbu ụmụnwaanyị n'ụlọ ndina na Pọtakọt, Rivas steeti . Ha sị na nwoke ahụ bụ onye Rivas Steeti si na okpuru ọchichị Buguma ma bụrụ kwa ọnye otu nzuzu akpọrọ debam. Nwoke a mere onye nke atọ ụweojii jidere maka echiche na aka ha dị na ogbugbu mmadụ a. N'Ofesi 'Anyị ka nwere ohere ikpe ụdo' Adel Abdul Mahdi Praịm Minista mba Iraq bụ Adel Abdul Mahdi adọọla aka na ntị ka egbochie ihe ọbụla ga-eme ga mba Amerika na Saudi Arabia lusoo mba Iran agha. O kwuru na agha dị otu a ga-agbasa karịa etu esi tụọ anya ma kwukwa na ohere dị ka achọọ ụzọ ụdo. N'Egwuregwu Manchester ji otu okpụ goolu Mason Greenwood nyere were merie N'asọmpi Ụropa agbara ụnyaaahụ ndị Manchester United ji otu ọkpụ goolu merie FC Asanta, Ebe ndị Arsenal ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu gbaa Frankfurt ose n'ụlo ha ma ndị Sporting Braga ji otu goolu merie ndị Wolves n'ụlo ha. Akụkọ ga-amasị gị Gee Nkeji Akụko Ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasi gị 'Di m sị anyị lawa na ọ na-abịa - Nwaanyị si South Africa lọta" afirika-48828910,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48828910,Ecowas Single Currency: Ihe i kwesiri ịma maka atụmatụ a,"N'ụbọchị 29 nke ọnwa Juun 2019, otu jikọtara mba ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas kwekọrịtara na aha a ga-akpọ ego mmekọrịta mba dị na mpaghara ahụ.","Ecowas - bụ otu nwere mba 15 n'ime ya - sị na aha ego ahụ ga-abụ ""Eco"". Nkwekọrịta bịara ka afọ 30 gachara kemgbe amalitere okwu inwe otu ego na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka tinyere ọkụ n'ite atụmatụ a ndị Ecowas na-esi. Mana, ihe ọtụtụ mmadụ amaghị bụ ihe nwepụta ego ọhụru a ga-apụta n'ahịa nakwa na mmekọrịta obodo mba dị iche iche n'ọdịda anyanwụ Afrịka? Ọ bụ n'afọ 2020 ka Ecowas sị na a ga-amalite rewe ego 'Eco' a, mana ọ dịghị ka ndị mmadụ ama maka nke a. Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya anụbeghị maka ihe a kpọrọ ""Single currency"". Nke a pụtara na ọrụ karịrị nke ndị Ecowas ga-arụ maka atụmatụ a. Mana ọbụghị naanị ime ka ndị mmadụ mata maka ego a dịrị ndị Ecowas. Ọ bụ n'afọ 1975 ka Ecowas malitere. N'ime mba 15 sonyere n'Ecowas, asatọ - Benin, Burkina Faso, Guniea-Bissau, Ivory Coast, Mali, Niger, Senegal na Togo - na-erikọta ego akpọrọ CFA franc. Atụmatụ 'Eco' a ga-eme ka mba ndị a kwụsị iri CFA franc. Ọfọdụ ndị na-akwado atụmatụ a na-ere etu mba ndị a ji na-erikọ CFA france ka etu Eco ga-esi gaa. Agbanyeghị nke a, onyeisi ndị na-enyocha ihe banyere akụnaụba ọha n'ụlọọrụ PwC West Africa bụ Andrew S. Nevin gwara ụlọ ntaakụkọ France 24 na ""Atụmatụ inwekọ ego a erughi erụ, ọkachasị etinye uche na Naịjirịa ebinyegbeghi aka n'atụmatụ nchịkọta ọdịda nnywanwu Afrịka."" Maazị Nevin gakwara n'ihu sị na inwe otu ego abụghị oke mkpa ugbua. ""Ị ga-ebu ụzọ hazie etu esi eme nkwekọrịta ndị ọzọ e nwere banyere azụmaahịa na mpaghara ahụ, ga zie hazie ihe mmepe obodo."" Farida Adamu bụkwa onye ọkammụta n'ihe banyere akụnaụba kwenyere na Afrịka adịbeghi njikere maka ego nwekọrịta. Adamu sị: ""Ya bụrụ na a ga-eme ya, e kwesiri ịhazị etu e si ere ego bụ nke Bekee kpọrọ ""Monetary Policy"", ọkachasị etu o si metụta mpaghara ndị emepebeghi nke ọma."" Ihe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA)" afirika-44714747,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44714747,Ihe ụlọikpe ji nye iwu ka e bido usoro ịchụda Buhari,Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo enyela ụlọomeiwu ohere ibido usoro ịchụda Muhammadụ Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala Naijiria ozigbo.,"Onyeisiala Muhammadu Buhari enweghị ndị kwusiri ike na-agbagha okwu ọchịchị ya Jọstis Maurine Adaobi Onyetenu nyere iwu n'akwụkwọ nke ụmụafọ Naijiria abụọ, Kanmi Ajibola, onye ọkaiwu na Sulaiman Adeniyi, onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye gbara sị ka ụlọikpe nye ụlọomeiwu iwu ka ha chụda onyeisiala Buhari. Mmadụ abụọ degara ụlọomeiwu nke ukwu(Senate) na nke nta(House of representatives) akwụkwọ mkpa ọ dị ka ha chụda onyeisiala n'ihi he ha kpọrọ imejọ iwu naijiria ma kwuo na ọ bụrụ na ha emeghị nke na ha ga-agba ha akwụkwu n'ụlọikpe. Mana ndị omeiwu emeghị ihe ha rịrọrọ nke mere ka ha ga uwa ụlọikpe ga-agba akwụkwọ riọ ka ụlọikpe nye sineti na ụlọomeiwu, ibido usoro ịchụda ya n'ọkwa. Na mkparịtaụka BBC na onyeọkaiwu Ajibola nwere n'ekwentị, o kwuru na mkpebi ahụ gbadoro ụkwụ na oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria nke Buhari akwụsịnwughị, egeghị mkpebi ụlọikpe na mmejọ ndị ọzọ onyeisiala mejọrọ iwuala Naijiria. ""Ụlọikpe mere mụ arịrịọ m nke bụ inye ụlọomeiwu (NASS) iwu ka ha bido usoro ịchụtu Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọkwa. ""Nke gbadoro ụkwụ na Buhari akwụsinwughị oke ogbugbu mmadụ nke naaga n'ihu na mpaghara Naijiria dị iche iche., erubeghi isi na mkpebi ụlọikpe and mmerụ dị iche iche o merụrụ iwu ala anyị."" Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ụlọomeiwu niile ga-aga mkpọrọ ma ọ bụrụ na ha nupu isi n'iwu ụloikpe nyere. Akụkọ ga-amasị gị:" 48637931,https://www.bbc.com/igbo/48637931,Gorilla: Ọzọdịmgba eloro nde naira asaa n'ogige ụmụanụmanụ nke Kano?,"Ndị uweojii na-ekwu na ha na-enyocha ihe mere ego ruru nde naira asaa bụ ego na-efu n' ogige ụmụanụmanụ, Kano Zoological Gardens, dị na Kano.","Ọzọdimgba ana-ebuzi ego? N'ụbọchị Wenezde, onyeisi nnakọta ego n'ogige ụmụanụmanụ ahụ kwuru na nde naira isii,narị asatọ na puku iri abụọ ha nwetara n'oge emume Sallh bụ ego ndị mmadụ kwuru were bata kirie ụmụ anụmanụ adaala mmiri. BBC enweghị ohere ime nchọpụta ka onwe ya. mana ndị ụlọakụkọ Freedom Radio Kano kwuru ụbọchị Tọọzde na otu n'ime ndị odebe ego ụlọụ ahụ kwuru na ' "" otu ọzọdịmgba rịbatara n'ụlọrụ ha buru eego ahụ lomie."" Mbọ BBC gbara ịnụta olu onyeisi ụlọanụmanụ ahụ amịtyaghị mkpụụ, n'ihi na o kweghị kwuo ma akụkọ ahụ emer eme ka ọ bụ na omeghị. "" A ka na-enyocha ihe mere ugbua, achọghị m ikwu ihe ọbụla banyere ya."" Otu onye na-arụ n'ụlọọụ ahụ nke achọghị ka a kpọrọ aha ya gwara BBC na ndị uweojii achụchiela ndị niile nọ ọrụ mgbe ya bụ ihe mere. Lekwa agwọ loro nde naira 36 Mgbe BBC kpọtụụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ Abdullahi Haruna, ọ sịị na, ""ọ bụ eziokwu na ego a nakọtara n' abali ise e mere emume 'Sallah' na-efu efu. Ka ọ dị ugbua, anyị anwụchiela mmadụ iri bụ ndị ọrụ ụlọ ụmụanụmanụ ahụ . Ha nọ na CID ugbua."" ""Ndị anyị nwụchiri gụnyere onye ncheọnụama ụlọụlọanụmanụ ahụ na ndị na-arụ na ngalaba nchịkọta ego."" Ihe anyị na-aghọta n 'okwu ahụ bụ mgbe ịnwetara ego abalị ise hapụ iburu ya ga dowe n'ụlọakụ."" Haruna kwuru na ndị ha ji eji ugbua bụ ndị nche nakwa ụfọdụ ndị na-ahụ maka ego n'ụlọ ụmụanụmanụ ahụ, ka ha kọwaa ihe kpatara na ha eburughi ego ahụ buga n'ụlọakụ. Cheta na n'ọnwa Febụwarị, onye ọụ Jamb kwuru na agwọ loro nde naiora iri atọ na ise. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48880209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48880209,Osun Decides: Oche gọvanọ Osun akwaala Adeleke kpam kpam,Adegboyega Oyetola nke APC emeriela Ademola Adeleke nke PDP n'ụlọikpe kachasị na ndọrọndọrọ ọkwa gọvanọ Osun steeti.,"Na mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere ,ha kwusiri ike na ọ bụ Adeboyega Oyetola meriri na ntuliaka ọkwa Osun Steeti. Mana ọkaikpe abụọ;Jọstịs Kumai Akaah na Paul Galinje n'ime asaa kpebiri ikpe ahụ akwụnyeghị ibe ha. Jọstịs Akaah boro Inec ebubo ime wuruwuru na ntuliaka mmeju ha mere n'ọsụn. N'otu aka ahụ, Jọstis Galinje kwuru na ụlọikpe elebanyeghị anya na ọgbaghara so ntuliaka mmeju ahụ. Okwu a si n'akara Twitter APC pụta ma seta foto ebe Oyetola na-enwe aṅụrị. Cheta na Inec kkpọpụtara Oyetola dịka onye meriri ntụliaka e mere n'afọ 2018 mana Adeleke gbaghara mmeri ya n'ụlọikpe. Na ntuliaka ahụ BBC nwetara ihe akaebe gosiri ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-anara ego ịtụ vootu. Ụlọikpe mbụ nyere Adeleke mmeri ahụ mana Oyetola gbaghara mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị, ebe ikpe si gaa ụlọikpe kachasị. Dịka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n'obi gọọmentidị n'Oshogbo." afirika-46843605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46843605,Otu AA nwere ike ịchụpụ Uche Nwosu na pati ha,Ndị otu Action Allaince(AA) nwere ike ịpịa Uche Nwosu bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha pati ahụ ụtari maka ịkwado onyeisiala Muhammadu Buhari.,"Onyeisioche otu pati ahụ n'Abuja bụ Kenneth Udeze gwara BBC na Uche Nwosu ikpọ ekwo nku na ịkwado Buhari nwere ike ibutere ya ntaramahụhụ pati ha. Udeze kọwara na tupu ha enye Nwosu ikike ịzọ gọvanọ Imo n'aha pati ha na otu AA na pati ndị ọzọ nọ na CUPP nwere nwekọrịta ịkwado Atiku maka ọkwa onyeisiala. Kenneth Udeze: Ọ bụ na ọ bụghị Buhari ị na-akwado bụ onye nọ n'Aso na-ele a nara gị oke ruru gi? O kwuru na inupu isi na-akwado Buhari bụ ịrụnye pati nyere ya ebe mgbaba oge a jụrụ ya ajụ. Ọ gara n'ihu sị, ""AA na-eleba okwu ahụ anya."" ""Mgbe kọmitii ọ dịrị inye ntaramahụhụ(disciplinary Committee) nyochachara okwu a ma tunye anyị aro, anyị ga-agwa ọha mkpebi anyị n'okwu ahụ."" Udeze jụrụ sị, ""Ọ bụ na ọ bụghị Buhari ị na-akwado bụ onye nọ n'Aso na-ele a nara gị oke ruru gi?"" Na ọsịsa ya, Uche Nwosu kwụsiri ike na ya ga-akwado Buhari n'ihi ya nwere ikike site n'iwu ala Naijiria ịkwado onye masịrị ya. Nwosu, onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ FCC Jones Onwuasoanya kwuru na AA enweghị ikike ịmanye mmadụ ime ihe amasịghị ya. Oge BBC jụrụ ya ma ọ ma na pati ahụ na-akwado ịchụpụ ya dịka onye otu ha ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, ọ sara Cheta na otu AA na ndị APC nwere kwanta n' ọgbakọ achụmta vootu nke pati ha mere n'Owere na izu gara aga. Ihe na-ese Uche Nwosu bụ onye ji aha AA azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti dịka ọ hapụrụ APC. O nwere mkpebi ịgbasa ozi achumnta vootu na-ekwu ka a tụnyere Buhari maka ọkwa onyeisiala. Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na nke a megidere pati ya bụ AA n'ihi n bụ ihe Bekeee kpọọ 'antiparty activities.' Barr Ifeanyị Ulumba kwuru sị, ""Anaghị eji ukwu abụọ awụ okwe. Mmadụ ịnọ na pati na-arụrụ pati ọzọ ọrụ."" Nma Olebara kwuru na agwa ahụ ""adịghị mma, sị na mmadụ 'a ghaghị arụọla John Holt ọrụ ga na Allen ga nara ụgwọ ọnwa."" Ha kwuru na agwa ahụ nwere ike ịkpatara ya ntaramahụhụ n'aka pati AA. Mana onyeisi mgbasaozi achumnta vootu Uche Nwosu bụ FCC Jones Onwuasoanya kwuru n'onweghị ihe ọjọọ dị na ya. Onwuasoanya sị ""Uche Nwosu nwere ikike dika iwu siri kwado onye ọ ga-akwado. O kwuola na ya ga-atụnyere na onye ọ chọkwara ka ndị na-akwadoro ya tụnre bụ Muhammadu Buhari."" Ọ bụghị naanị Uche Nwosu bụ onye nọ n'otu pati na-akwado pati ọzọ. Nna ya ukwu maburu kwa ọgọ ya nwoke bụ Rochas Okorocha nọ na APC ma na-akwadọ Nwosu nọ n'otu AA. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45319237,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319237,Ọ bụ olu nwa anyị nọ n'igwe okwu - Ndị nwe Leah Sharibu,"Anụrị bụ ihe nne na nna Leah Sharibu jiri nabata olu ha nụrụ n'ime igwe okwu ụnyaahụ, makana ha sị n'olu ha nụrụ gosiri na nwa ha ka nọ ndụ.","Bụghị ụmụakwụkwọ Dapchi a tọrọ ji ndụ ha lọta Nna Leah Sharibu gwara BBC na ọ bụ onu nwa ya, bụ otu onye fọrọ n'ime umụaka Dapchi nari na iri ndi omekome Boko Haram kpara aka n'afọ a. N'ime okwu ahu anụru n'igwe okwu, nwaada Sharibu, bụ onye aka ji kemgbe ọnwa abụo nke afọ a, rịọrọ onyeisiala Naịjirịa ka o mere ya ebere hụ na anapụtara ya n'ime ajọ njem a ọ nọ. Ụmụakwụkwọ 76 ka a kpọghachitere ""Obi dị anyi ụtọ, obi dị anyị ụtọ, maka na anyị mazị na nwa anyị dị ndụ,"" Nna ya kwuru. Gọọmentị Naịjirịa n'otu aka ahụ kwenyere na uche ha dị na igwe okwu a metụtara Leah Sharibu. Garba Shehu, bụ onye ndụmọdụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe banyere mgbasa ozi dekwara na ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ya bụ okwu, ma kwuo na onyeisiala ga-eme ihe niile ịhụ na nwa natara n'udo. Ihe a bụ mbụ anụrụ onu maọbụ hụ Leah Sharibu kemgbe atọọrọ ya na umụakwụkwọ ibe ya na Dapchi. Ebe ahapụrụ ndị ọzọ, eji Leah maka na okweghi na ọ ga-ahapụ ofufe kraist bụru onye alakuba. Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46649822,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46649822,Rochas: Uzodinma anataghị ikike iji ama egwuregwu mee achụmmnta vootu,Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole ekwuola na pati ha agaghị abụkwa ebe a na-ele mmadụ anya n'ihu ị ma onye o metụtara tupu o nweta ọkwa.,"Sinetọ Hope Uzodinma hiwere mmalite achụmnta vootu ya ụbọchị 21 ọnwa Disemba 2018 O kwere nkwa na kama pati ha ga na-agbaso usoro onye kwue uche ya. Oshiomhole kwuru nke a na mmalite achụmmnta vootu Sinetọ Hope Ụzọdịnma,onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha APC n'Owere ụbọchị Fraide. Ọ gwara ndị otu pati ha na ya ji ""ozi Olileanya bịa"" O gara n'ihu sị, ""Ọ gaghị eme ọzọ na mmadụ ga-abanye n'ọchịchị maka na ọ bụ ọgọ nwoke maọbụ nwanne onye ma ọbụ onye ọzọ."" Ndị APC kara aka nọ na ọgbakọ ahụ A na-atụ anya onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari, mana Oshiomhole, Andy Uba,Ayogu Eze, Uche Ogah so na Ndi APC nwere agba bịara n'ọgbakọ ahụ. Mana ozi onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahu wetara anyị na-ekwu na ndị ụlọomeiwu APC na steeti ahụ dị mmadụ 27 awụchiela n' isi ụlọrụ APC na steeti ahụ. A kpọchiri ebe Uzodinma chọrọ ime mmalite achụmmnta vootu n'Owere E hiweburu mmemme ahụ n'ama egwuregwu Dan Anyiam mana akụkọ ruru anyị ntị kwuru igwe ndị mmadụ ndị gbakọrọ maka ya emeghị ịke ịbanye n'ihi na a gbachiri ebe ahụ agbachị . Nke a mere na ha nọrọ n' isiụlọọrụ APC dị n'Okporoụzọ Okigwe mee ya bụ ọgbakọ. A na-eche na ọ bụ ndị ọrụ gọọmenti Rochas Okorocha kpọchiri ama egwuregwu ahụ. Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo n'ekwentị, o kwuru na Uzodinma etinyeghị akwụkwọ iji nata ikike iji ama egwuregwu ahụ mee ihe n'aka Kọmịshọna ọ dị n'aka. N'aka nke ọzọ, otu onye ndị mgbasaozi achumta vootu Udodinma gwara BBC Igbo na ha kwụrụ puku narị naira asatọ na iri ise(N850,000) maka iji ama egwuregwu ahụ mee ihe ma natakwa ikike site na directọ na-ahụ maka egwuregwu na steeti ahụ. N'ihi mkpọchị ahụ, Okporoụzọ Okigwe tachiri atachi n'ihi ọtụtụ ndị na-akwado APC pụtara n'igwe maka emume ahụ." afirika-46498186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46498186,Peter Obi: Ọ bụghị ụnyaahụ ka a kpachiri ọbaego ya - Ike Abonyi,"Onye ndụmọdụ Uche Secondus bụ Ike Abonyi, gwara BBC na o teela aka a kpachiri ọbaego Peter Obi.","Ọ gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ n'ime izuụka gara aga ka Peter Obi chọpụtara na o nweghi ike iwere ego n'ọbaego ya. ""Ọ malitere ịkọrọ ndị otu PDP nke mere na ha depụtara akwụkwọ ịkatọ ya bụ ihe"" bụ ihe Abonyi kwuru. Ka otu PDP wepụtachara akwụkwụọ na-akatọ etu e si kpachie ọbaego niile Peter Obi na ndị be ya nwere, ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Val Obienyem, kọwara na ihe dị etu ahụ mere n'ezie. Obienyem kwuru na ụjọ adịghị atụ ha makana ọ maara na aka Peter Obi dị ọcha. O kọwara na ha ji ndidi eche ka gọọmentị etiti bụ ndị ha na-atụ aka pụta kwuo ihe mere ha ji kpachie ọbaego Obi ka ha wee saghachị ha makana ""ahụ okwu, ahụ ọsịsa ya"". O kwuru na kamgbe ihe a mere, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ makana Obi bụ onye ndị mmadụ nabatara dịka onye na-azọ oche osote onyeisiala n'okpuru pati PDP. Cheta na otu PDP site n'aka ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kola Ologbondiyan, depụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Dec 8, 2018, na-akatọ mkpachi a kpachiri ọbaego Obi. Otu PDP kwuru na ọ bụ makana ụjọ ji otu pati APC maka etu ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si akwado Atiku na Obi. N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ EFCC bụ Tony Orilade, ekwuola na aka ha adịghị na mkpachi ọbaego Obi. N'ọnụ ya, ""ebela ọyọrọ ọyọrọ ebe ọ na-ekwesighị ka e bee ya."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49275696,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49275696,"Ngozi Okonjo-Iweala, Uche Jombo na ụmụnwaanyị Abia state aha ha na-ada ụda na Nigeria",E nwere obodo a ga-akọgide akụkọ ha ghara ịkọta maka maọbụ kpọta ụmụnwaanyị ha aha?,"I cheta ngagharịiwe ụmụnwaanyị Aba nke a ma dịka 'Aba Women's Riot', ị mara na ọ bụghị taa ka ụmụnwaanyị Abịa kpawara ike. Dịka e si ekwu na ""n'azụ nwoke ọbụla na-eme ọfụma, ị ga-ahụ nwaanyị na-akwado ya"", etu ahụ ka ọ dị n'obodo dị iche iche. Na obodo dị mma bụkwanụ na e nwere ụmụnwaanyị na-eme ihe ọma e ji eme ọnụ. BBC Igbo chọrọ igosi gị ụmụnwaanyị Abịa steeti na-eme/mee ihe ndị mmadụ ga-eji cheta ha. Angela Johnson Kedụ etu ị ga-esi chefuo aha ya, ọ kachasị etu a o si zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Alliance for a United Nigeria (AUN) na ntuliaka 2019? Johnson abụghị naanị onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa onye ọkaiwu, ụkọchukwu nakwa onye na-ede akwụkwọ ndị ụka. A mụrụ ya n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba, 1959. Ngozi Okonjo-Iweala Okonjo-Iweala bụ minista na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa oge Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa N'agbanyeghi na a mụrụ ya na Delta steeti, mana a ga-agụnye ya n'okpuru ụmụnwaanyị Abịa steeti makana ọ bụ ebe ahụ ka a na-alụ ya. A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala? A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya. A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm. Ọ bụ onye ihe gbasara ego na nchịkọta akụnaụba doro anya ọfụma. A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, 1954. Nkeiruka Onyejeocha Ọ bụ onye ụlọomeiwu nta nakwa onye azụmahịa. Ọ rụọla dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị Isuikwuato/Umunneochi kemgbe afọ 2007, ka ọ rụchara dịka kọmishọna na steeti ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba, 1969. Chinyere Kalu Kalu enwetala ọtụtụ ihe nrite gbasara aka ọrụ ya dịka ọkwọụgbọelu Kalu na-azabu Onyenauche (nke bụ aha nna ya), bụ nwaanyị mbụ fere ụgbọelu dịka ọkwọụgbọelu na Naịjirịa. N'afọ 2006, onye bụ onyeisiala Naịjirịa mgbe ahụ bụ Goodluck Jonathan, nyere ya nturuugo ""Member of the Federal Republic of Nigeria"". A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1956. Nnenna Elendu Ukeje Elendu-Ukeje arụọla n'ụlọomeiwu nta afọ 12, kemgbe ọ malitere n'afọ 2007. Ọ na-anọchite anya ndị Bende n'ụlọomeiwu. A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba, 1969. Arunma Oteh Oteh bụ otu onye a na-asị ""unu abịala"" n'ihe gbasara akụnaụba na mkpata na mmefu ego. Oteh arụọla n'ọtụtụ ebe aha ha na-ada ụda ma a bịa n'ụwa akụnaụba; nke gụnyere World Bank, Securities and Exchange Commission nke Naịjirịa nakwa Harvard Institute for International Development, dgz. O nwetala nturuugo 'Officer of the Order of the Niger' na Naịjirịa. Ọ gụrụ maka kọmputa na mahadum. A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Jenụwarị, 1965. Nkechi Justina Nwaogu Nwaogu bụbu onye ọrụ ụlọakụ Nwaogu arụọla dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị Abịa Sentralụ n'Ụlọomeiwu Ukwu kemgbe afọ 2011. Ọ kwụsịrị ịrụ dịka onye omeiwu n'afọ 2015, mgbe T.A Orji zọtara oche yaTupu ọ banye n'ụlọ omeiwu Ukwu, ọ nọburu n'Ụlọomeiwu Nta bido n'afọ 2003 rue afọ 2007. A mụrụ ya n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 1956. Adaobi Tricia Nwaubani Nwaubani bụ onye na-ede akwụkwọ nakwa onye ntaakụkọ a ma ama. O nwetala ọtụtụ ihe nrite nke gụnyere ""Commonwealth Writers' Prize"". A mụrụ ya n'afọ 1976. Uche Jombo Uche Jombo enwetala ọtụtụ ihe nrite maka ime ejije Ọ bụrụ na ị na-ele ejije ndị Nollywood ma ị maghị onye nwaanyị a bụ, i lewela? Jombo na-eme ejije dịka ""actress"" ma na-emepụtakwa ejije dịka ""director"". A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1979. Ihuoma Linda Ejiofor-Suleiman Ejiofor bụ onye na-eme ejije na Nollywood (o so na ndị a na-akpọ ndị Nollywood ọgbara ọhụrụ). A họpụtala ya maka inweta ihe nrite dị iche iche nke gụnyere ""nwaanyị kachasị eme ihe nkiri"". A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa July, 1986. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" afirika-44260012,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44260012,Popu Francis ahọpụtala bishọpụ ọhụrụ ga-akwado bịshọpụ Enugwu,Onye nlekọta ụlọụka Katọlik n'ụwa niile bụ Ọkachasị nsọ Popu Francis ahọpụtala Ụkọchukwu Fada Ernest Obodo dịka bishọpụ ga-akwado dayọsis ụka katọlik n'Enugwu.,"Popu Francis Nhọpụta a dị n'akwụkwọ Vatican depụtara taa. Tupu nhọpụta a, Obodo bụbu onyeis ụlọ nke Saint Bernard Senior Seminary ebe ụmụakwụkwọ na-ebi ma bụrụkwa onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ Bigarad Memorial Seminary dị n'Enugwu. Popu họpụtakwara ya dịka onye nlekọta Mediana. A mụrụ ya ụbọchị 24 ọna Oktoba afọ 1966 n'Awha-Imezi n'Enugwu. Ọ bara ụlọakwụkwọ seminarị nke nta ""Sacred Heart' ebe ọ gụrụ Filosofy na Tiọlọji n'ụlọakwụkwọ seminari ukwuu nke Bigard dị n'Enugwu. E chiri ya ụkọchukwu ụbọchị 22 ọnwa Julai afọ 2002 na dayọsis Enugwu ma kamgbe e chiri ya echichi ahụ, o jidela ọtụtụ ọkwa na dayọsis ahụ. Ọkwa ndị o jirila gụnyere ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka ""Queen of Hoky Rosary"" bido afọ 2000 rue afọ 2001, ụkọchukwu nke ""saint Charles"" n'Amechi Idodo bido n'afọ 2001 rue afọ 2004 nakwa onye mgbazi n'ụlọ ebe ụmụakwụkwọ na-ebi na ""Saint Bernard's Seminary"", Nchatancha. Ọ bụkwa odeakwụkwọ ndị ụkọchukwu na dayọsis Enugwu nakwa onye nlekọta otu Saint Juudu na onye otu kọmishọna ndekọ na dayosis ahụ bido afọ 2004 rue afọ 2009. Bido afọ 2010 rue afọ 2016, ọ gụrụ akwụkwọ ọkachamara na mahadum Innsbruck dị n'Ọstria. Kamgbe afọ 2016, ọ na-rụ dịka onyeisi ụlọakwụkwọ ""Saint Bernard Senior Seminary Hostel"" nakwa onye nkuzi n'otu ụlọakwụkwọ ahụ n'Enugwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45076823,https://www.bbc.com/igbo/45076823,Ndị na-agba bọọlụ n'Enugwu nwere obi mgbawa maka ọnwụ Supremo,Onye nkuzi bọọlụ a ma ama dịka Jaganza Supremo kuziburu ụfọdụ otu bọọlụ na Naịjirịa anwụọla taa.,"Dịka akụkọ si kwuo, Supremo kuziburu otu egwu bọọlụ N-WL1 na Lamray United. E kwuru na Supremo kwuru okwu maka obi mgbu dịka o gwuchara egwu n'abalị ụnyaahụ mana o mechara nwụọ n'isi ụtụtụ taa. Ọtụtụ ndị hụrụ bọọlụ n'anya gara na soshal midia ikwu etu ha si nwee obi mgbawa maka ọnwụ a. Otu onye ọkachamara n'egwu bọọlụ n'Enugwu bụ Osondu Ngwude, gwara BBC Igbo na Supremo bụ otu onye na-achọpụta mana azulitekwa ndị ọgba bọọlụ oge ha dị obere n'otu bọọlụ nta. N'okwu ya; ""Spremo bụ otu nkuzi bọọlụ na-aba n'ime obodo achọpụta ndị nwere onyinye ịgba bọọlụ. ""O so na ndị zụlitere ọgba bọọlụ Okocha oge ọ nọ n'Enugwu."" Ngwude kwuru na o chọrọ ịlọghachite tinye isi n'otu welitere isi dịka Delta Force mana o melighizi tupu ọ laa mmụọ. Supremo so n'aka ochie ndị nkuzi egwu bọọlụ na Naịjirịa, n'okwu Ngwude; ""O so n'otu Christian Chukwu na Shaibu Amodu lagokwara mmụọ."" Ihe ndị ị na-amaghị maka Supremo Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Zico Martinez nọrọ na Facebook bee akwa arịrị maka ọnwụ onye nkuzi ya Gbenou Nestor bere nwịị na dike alala na Naịjirịa maka ụbụrụ ya bụ ego ya. Austin Okafor ka na-ekpe ka ọ bụrụ asị. Gbenou Nestor kwuru n'otu ""All Stars"" na Naịjirịa tufuru ihe buru ibu n'ọnwụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45762918,https://www.bbc.com/igbo/45762918,Oby Ezekwesili a ga-ebute mgbanwe Naịjirịa chọrọ?,Aha Oby Ezekwesili yiri ọkụ na-agba n'ụgụrụ ugbua dịka ọ na-ewu ebe niile.,"Ọ bụ n'ihi ozi o depụtara ụnyaahụ na ya esonyela ọsọ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. Ụfọdụ na-ekwu na ọ nweghi ike ị meri Buhari na ndị ọzọ na ntuliaka ahụ. End of Twitter post, 1 Ndị ọzọ na-ekwu na ọbụrụ na ihe niile dị nhatanha, ọ bụ Ezekwesili kwesiri ịchị Naịjirịa. Mana n'ihe a niile, Oby Ezekwesili ekwuola na ihe oji abịa bụ ""Olileanya"". Onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Dare Babatunde gwara BBC Igbo n'ekwentị na Ezekwesili bụ ihe na-agụ Naịjirịa ugbua. ""Anyị na-achọ onye ga-emebi ihe dị ugbua ma wugharia ya, ọ bụ ya ka Oby ga-eme"". Akụkọ ga-amasị gị" mba-uba-43198956,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43198956,Otu ụka Kraist: Israel na-emegide ụka Kraist,"Ndị ndu otu ụka Kraist gunyere; ndị ụka Katolik, Greek na nke Armenian kwekọtara imechị ụlọụka ahụ a kpọrọ, 'Church of the Holy Sepulchre' nke bụ ebe a kpodoro Jesụ Cristi n'obe n'ihi ihe ha kpọrọ, agha megide otu ụka Kraist.","E mechiela ụlọụka Holy Sepulchre dị na Jerusalem Nke a mere ka ndị ọchịchị wepụtara iwu ọhụrụ nke kwuru na ụlọụka ga na-atụ ụtụ isi maka ewumewe ha nwere ya na iwu nke a na akwado ime n'ụlọ omeiwu nke ga-eme ka o sie ike ile ewumewu ndị ụka. Dịka ụlọ ntaakụkọ Telegragh nke UK siri kwuo, na akwụkwọ ozi ndị ndu ụka Kraist atọ kachasị na Jerusalem wepụtara, ha kwuru na ụtụisi ọhụrụ ahụ bụ 'atụmatụ ọjọọ' megide ụka Kraist. ""Agwa ndị a megidere nkwekọrịta na iwu mba ụwa dịka o siri mmetụta ikike na elele dịrị ndị ụka Kraist nọ Ala nsọ Jerusalem na ndị ọchịchị obodo."" ""Iji gosi iwe anyị, anyị ekpebiela imechi ụlọụka, 'Church of the Holy Sepulchre'. ""Ndị isi ụka nile nọ na Ala-Nso kwekọrịtara ma kwụsieike na ichekwa ikike dịrị anyị na ihe anyị nwere."" Onweghị ọsisa ndị ọchịchị nyere. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe karịrị ọkara nde mmadụ ( 500,000) bu ndị njem ndị otu Kraist na-aga Israel kwa afọ, ebe njem mkpagharị so otu ihe na-enye mba Israel ego ikwalite akụ na ụba. Nke a bụ nke mbụ a na-emechi ụlọ ụka kemgbe 1990 oge emechiri ya iji gosi iwe megide ndị ndị Israel iwere ọnọdụ n'ụlọụka. Onweghị onye ma mbge a ga emeghe ya bụ ụlọụka dịgoro otu puku afọ ọzọ." afirika-52040817,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52040817,Anambra Catholic Priest: Ihe ndị uweojii kwuru maka Fada a hụrụ ozu ya n'ime ụgbọala,"Dịka akụkọ maka ọnwụ Fada Charlse Okeke-Odogwu na-ewu na Soshal Midịa, Kọmishọna ndị uweojii nke Anambra steeti nyere iwu ka emee nyocha maka ọnwụ onye ụkọchukwu a.","Fada Okeke-Odogwu bụ ụkọchukwu na-achịkọta Holy Cross Parish, Oroma-Etiti dị n' Anam, n'Anambara Steeti. Mgbe ndị uweojii gara Oroma-Etiti ebe ọ mere, ha mere nyọcha ha ma chọpụta na ọ bụ ọnwụ chi ya na-enweghị ihe nrụrụaka dị na ya. Ha gwa kwara ndị ezinulọ Okeke-Odogwu ka ha ga n'ụlọọrụ ndị uweojii gaa dee akwụkwọ maka ọnwụ ya. Ndị mmadụ hụtara ozu Okeke-Odogwu n'ime ụgbọala ya n'ụbọchị Tuzde. Akụkọ na-ekwu na Odogwu soro mee nzụkọ ndị 'Diocese' ya ma na ogosịghị ihe mgbaama na-ahụ adịghị ya. Kama, kepukepu na-ekwukwa na ọgbọrọ agbọrọ tupu ọnwụọ n'ime ụgbọala ya. Tupu ọ nwụọ, Okeke-Odogwu bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ 'Father Ohai Memorial Secondary school, Oroma-Etiti, Anam, Anambra steeti'. Nwoke gbagburu nwa ya nwoke maka ebubo na o gburu nna ya Akụkọ na-ekwu na nwoke aha ya bụ Cyril Ugwu gbagburu nwa ya nwoke aha ya bụ Kenneth Ugwu. Akụkọ na-akọwa na Kenneth onye na-azụ ahịa ahụ ụgbọala na Legọs lọtara were sị nne ya ka ha gaa gbute akwụ n'ubi. Ọ bụ mgbe Kenneth lọtara nanị ya were sị nna ya na ya ga-alaghachị Legọs ọsịsọ. Nkea mere ka nna ya nyọwa ya enyo were gaa n'ime ọnụ ụlo Kenneth ebe ọ hụrụ isi nwunye ya nwa ya nwoke tinyere n'akpa. Cyril Ugwu jiri egbe ya gbagbuo Kenneth ma gosi kwa ndị mmadụ isi nwunye ya mgbe ha gbatara. Ndị obodo mechara gaa n'ọhịa ebe ha hụrụ ozu nwunye Cyril Ugwu. Onye na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii Enugwu steeti na ndị ọha bụ Daniel Ndukwe Ekea kwuru na ha nwetere mkpesa maka ya kama ha-enweghị ike ikwu ma ọ bụ eziokwu ụgbụa." afirika-44763031,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44763031,Ọ bụghị iwu ka Okoroọcha ga nzukọ ndị isi ọwụwa anyanwụ maka ndị ọchiehi - Onwuemeodo,Onye ode akwụkwọ gọọmentị Imo Steeti bụ Sam Onwuemeodo ekwuola ihe mere gọvanọ Rochas Okorocha agaghị nzukọ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ mere.,"Imo Steeti: Ndị gọvanọ ndị ọzọ ga-aza ajụjụ nzukọ BBC Igbo chọpụtara na gọvanọ Steeti ndị ọzọ gara mana gọvanọ Okorocha agaghị ma onweghi onye nnọchite anya na nzukọ ahụ. N'ajụjụ ọnụ agbara Sam , o kwuru na ọ bụghị iwu na gọvanọ ga-aga nzukọ ọbụla ma akpọrọ ya ma akpọghị ya. O kwuru na onweghi iwu machiri onye gọvanọ ịza oku ọbụla akpọrọ ya, na ọ ga-aza oku nke ọbụla ọ chọrọ ịza. Mgbe ajụrụ Sam Onwuemeodo ma gọvanọ Okorcha ọ kwadoro mkpebi ndị gọvanọ mere na mkparịta ụka ahụ, o kwuru na ọ bụ naanị ndị gara nzukọ ga-aza ọnụ mkpebi ha mere. O kwuru na ọ bụrụ ha chọrọ ikwu okwu banyere nke a, na ha ga-edepụta n'akwụkwọ ozi ebe ọ ga-edo ọha anya. Cheta na ndị gọvanọ bịara nzukọ a gụnyere Dave Umahi nke Ebonyi steeti, Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Ikem Okeke osote gọvanọ Anambra steeti na Ude Oko chukwu osote gọvanọ Abia steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45745412,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45745412,Jos: Ndị isiekweọnwụ egbuola mmadụ 13,"Isi mmadụ 13 abanyela n'ọgbaghara dapụtara ọhụrụ na Riyom, okpuru ọchịchị nke Nọt-Sentral nke Platu Steeti.",Ndí uweojii kwuru na ihe karírí mmadú 86 anwúbúola na Barkin Ladi Jos mgbe gara aga Emmanuel Danboyi Jugu bụ onyeisi ndị Kọmitii na ahazi ihe kwuru na ha elielarị mmadụ iri nke gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị. Ụnyahụ ka ndị Mahadum nke Jọs kwuru na ha achọtala onye ahụ a na-achọchọ kemgbe ọgụ nke ikpeazụ a bidochere ebe ahụ. O doghị anya mgbe tigbuo zọgbụo a gaa-ebe na Plateau mana ihe dooro anay bụ na ndị obodo na ndị ọrụ nchekwa esighi otu ụzọ agafe bụ nke were ike ịnye aka belata ya bụ ọgbaaghara. Major-General Augustine Agundu bụ onye nọchitere anya chief Lt-Gen Tukur Buratai mgbe eliri ndị agha atọ nwụrụ na Septemba na Barkin Ladi kwuru na ọ dịka ọ bụ ndị Eze obodo so akwanye ọkụ na ya bụ ọgụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Terna Tyopev sị na ha enwetachabeghị nke bụ ezi okwu na ya bụ mkpamkpa nke kpara nsonso a bụ nke metutere ndị Berom bi na Riyom. Mazi Jugu kwuru na achọpụtala ozo mmadụ atọ ọzọ nwuru na ọgbaaghara ahụ. afirika-50122506,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50122506,Lawyers' Wigs: Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?,Ịbụ onye ọkaiwu so n'otu ọrụ kacha nwee ugwu n'ụwa.,"Ndị ọkaiwu bụ ndị a ma dịka ndị ma oke akwụkwọ ma burukwa iwu obodo niile n'isi. Ekike e ji mara ndị ọkaiwu na-apụkwa iche ma nwekwaa mpụtara dị icheiche. Ekike ndị a gụnyere uwe ogologo ojii na okpu ọcha a na-akpọ 'wig'. Gịnị ka okpu ndị ọkaiwu pụtara? Okpu ndị ọkaiwu Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọbụ na mba Ịngland ka ụdị ekike ahụ malitere. N'oge ahụ, ọbụ naanị ndị ọgaranya na-ekpu okpu pụrụ iche iji gosi akụnụba ha. Ọbụkwa ndị ọgaranya na-abụkarị ndị ọkaiwu n'oge ahụ, nke a mere na ha na-eyi uwe ogologo ma kpurukwa okpu pụrụ iche. Mana ugbua, n'obodo ndị mepere emepe n'akụkụ ụwa niile, ndị ọkaiwu anaghịzi ekpu ụdị okpu ahụ. Ọ ka mma ka emelaa okpu ndị ọkaiwu a na Naịjirịa? Ọkaiwu Amarachi Ugwunna BBC Igbo gbara otu onye ọkaiwu aha ya bụ Amara Nwabueze ajụjụ ọnụ. Nwabueze bụkwa onye nkuzi na ngalaba iwu na Mahadum Abiịa Steeti. O kwuru na ọbụ eziokwu na ekpomọkụ buru ibu na Naịjirịa, mana nke ahụ ezughị iji sị ka akwụsị ya. O kwuru sị: ""Ịbụ ọkaiwu bụ ọrụ nwere nnukwu ugwu, o kwesịrị ka a na-akwanyere ya ugwu."" ""Ọbụrụ na a sị onye ọbụla yiri ihe dị ya mma bịawa n'ụlọikpe, ndị mmadụ ga-emechu ugwu a na-akwanyere ọrụ ọkaiwu."" Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia E tu esi achọputa ọkaiwu adigboroja Ụfọdụ na-ekwu na Naịjirịa ekwesịla ịgbajọ okpu nakwa uwe ogologo ndị ọkaiwu na eyi. Ọkaiwu Chidi Odinkalu kwuru okpu ahụ adịghị mma maka ahụike mmadụ n'ihi oke ekpomọkụ dị na Naịjirịa. Ike Aguata kwuru na ihe izi ọ ga-eme ma o nwee ohere bụ ịkwụsị ya bụ uwe ogologo nakwa okpu. Mana @effe_ndi kwuru na ndị ọkaiwu na mba UK ka na-ekpukwa okpu ahụ ma abịa n'ikpe dị aghaa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Onitsha fire: ""Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?" afirika-44459648,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44459648,Gịnị mere nzu ji dị mkpa n'ala Igbo?,"Nzu bụ ihe pụtara n'onwe ya n'ime ala bụbu akpụkpụ eju dị n'ime ala ruo ọtụtụ puku afọ, mana i nwere ike iji aja, nzu sị na nkụ pụta, na kwa nnu agwọkọrọọnụ nwere mee nzu.","Ọtụtụ ndị Igbo kwete na nwaanyị di ime racha nzu nwa ya dị n'afọ ga-apụta n'ụcha Gịnị ka eji nzu eme n'ala Igbo? N'ala Igbo oge gboo, nzu maọbụ ọjị bụ ihe e ji anabata onye ọbịa. Mgbe ahụ, ị bata na bee nwaafọ Igbo ọbụla, ha ga-enye gị nzu ka ite na njibi aka gị. Nke a bụ maka igosi na obi gị nakwa ọbịbịa gị dị ọcha. Nzu bụ ihe dị mkpa e ji egosipụta amamihe. Ndị okenye na-aka nzu n'ala. Ihe a bụ igosi n' ebe ha nọ bụ ebe dị nsọ maka na ndị Igbo nwere nkwenye na onye ọbula were nsọ 'chi' n'ime ha. Ndị bekee nwere nzu nke a akpọrọ 'White Chalks' Emume a bụkwa maka ịkwanyere ala ugwu. Igbo nwere nkwenye na ọ bụ sọọsọ onye nwere obi ọcha ga-enwe ike ime nke a. Nzu dịka ọgwụ ịgwọ ọrịa Ruo ugbua, ọtụtụ ụmụnwaanyị nakwa nwoke na-ata nzu maka na ọ na-atọ a ụtọ mana ọ bụ ụmụnwaanyị di ime na-ata nzu nke ọma maka ịkwụsị agbọ na kwa oke asọ mmiri ọnụ. Ụmụnwaanyị di ime na kwa na-ata nzụ maka ịgwọ ọrịa nke ụtụtụ akpọrọ 'Morning Sickness' na bekee. Mana otu dị icheiche na-ahụ maka ahụ ike na-adọ aka na ntị na udi emume ga-ebute nnukwu ọrịa makana ọ nwere kemikal akpọrọ lead na arsenic. Aha nzu n'ala ndị ọzọ Ndị bekee kpọrọ nzu 'Chalk'. Ndị French kpọrọ ya 'La Craie' maọbụ Argile. Ndị Calabar na-akpọ ya 'Ndom', ebe ndị Bini kpọrọ ya 'Eko.'" afirika-49521360,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49521360,Enugu Airport Closure: Lee etụ ị ga-esi hazigharia njem gị tupu a gbapee ọdọụgbọelu Enugu,Mmechi e mechiri otu ọdọ ụgbọelu eji aga mba ụwa dị n'ọwụwa anyanwụ bụ ọdọ ogbuelu Akanụ Ibiam dị n'Enugwu a bụghịzi akụkọ eji nwayọ ekwu.,"Ihe gọọmentị etiti kwuru na ọ bụ kpatara mmechi a bụ ka ha nwee ike rụọ ya ọrụ ka njem ndị mmadụ na-adị mfe. Mmechi a abụrụla ihe oke echiche nye ndị njem ebe ọdọụgbọelu ndị ọzọ ha nwereike iji dị ezigbo anya dịka nke Owerri, Port Harcourt na Asaba. Gụnyekwara na okporo ụzọ e si aga ebe ndị a adịchaghị mma nakwa ndị omekaome juru n'ụzọ. Etu ụzọ si Enugwu gawa Owerre dị N'ime akụkọ a BBC Igbo nyere ntuziaka etu onye njem si n'Enugwu ga-esi aga n'ọdọ ụgbọelu ndị ọzọ ahụ. Nke bụ onye si ọdọ ugbọelu ndi ọzọ na Naịjirịa aga Igbo o mara nke ga-akarị ya mfe. Ngwa, lezia ka o si kwụrụ: A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu Ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owerri: Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Sam Mbakwe na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọ ụgbọelu a ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere; Ọdọụgbọelu Port Harcourt: Ọdọ ụgbọelu a bụ nke esikwa mba ofesi efelata maọbụ fegaa. Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Port Harcourt na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọ ụgbọelu Port Harcourt ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere; Ọdọụgbọelu Asaba dị na Delta Steeti: Onye ọbụla si ọdọụgbọelu Asaba na-aga Enugwu ma ọ bụ si Enugwu na-aga ọdọụgbọelu Asa ga-agba okporoụzọ ndị gụnyere; Kedụ ka ọnọdụ nchekwa okporo ụzọ ndị dị? Na nso nso ọtụtụ okporoụzọ ndị dị n'ọwụwa anyanwụ nwere nsogbu nchekwa n'ihi oke ohi na ntọrị ndị mmadu site n'aka ndị omekaome. Nke a mere ndị mmadụ na-achị obi ha n'aka oge ọbụla ha na-agba n'ụzọ ndị a ka ọfọdụzie ugbu e mechiri ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Mana gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na ogbo ya nke Ebonyi Steeti bụ David Umahi ekwela nkwa ihiwe nchekwa nye njem si na Steeti dị iche iche. N'okpro ụzọ dị gasi n'Enugwu, gọọmentị na-asụmị ọhịa iji gbochie ebe ndị omekome na-anọ. N'otu aka ahụ, e hiwela ogige ndịagha ruru anọ n'okporoụzọ si Enugwu gawa Okigwe nakwa ndị uweojii n'okporoụzọ ndị ọzọ. Dịka ọ dị ugbua amabeghi mgbe a ga-arụcha ọrụ n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam nke Enugwu. Etụ ị ga-esi hazie njem gị Nyocha njem gị, mata ọdọ ụgbọelu nke ga-akara gị mma, ijee mata ụgbọelu nke na-aga ebe ahu, kwụọ ụgbọ n'oge were malite. Mana, matakwa na onweghi ụzọ ọbụla esi aga ihe dịka Enugwu na Ebonyi site ọdọ ụgbọelu ndị a dị ka o siri kwesi. Ije ọma Okporoụzọ ala Igbo" afirika-49869003,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49869003,Sowore in Court: 'Aka m dị ọcha',"Ụloikpe ukwu dị n'Abuja eyigharịala ikpe ntọghapụ Sowore Omoyele , onye nchịkọta 'Revolution Now' rue Ọktoba 4.","Sowore na onye otu eji bụ Olawale Bakare gwara ụlọikpe ukwu ahụ na aka ha dị ọcha gbasara ebubo asaa gọọmenti etiti boro ha. Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu kagburu arịrịọ ọkaiwu ha bụ Adeyinka Olumide-Fusika (SAN) ka akwụsị iyigharị nkpụpụ Sowore na onye otu ya ọzọ. Onye nwe ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ Sahara Reporters ma bụrụkwa onye nchịkọta 'Revolution Now ' bụ Sowore Omoyele erutela n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka o wee zara ọnụ ya ka gọọmenti etiti boro ya ebubo imebi obodo na nrụrụaka ndị ọzọ. Ọ bụ ndị Department for state services (DSS) kpọ ya bata n'ụlọikpe ahụ n'elekere itoolu nke ụtụtụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Sepụtemba. Mgbe o rutere ebe ahụ , o na-eti 'Revolution' ndị otu ya a na-aza 'Now' dịka ndị ntakụkọ Punch si depụta. A ga-ekpe ya ikpe n'ihu ọkaikpe Ijeoma Ojukwu n'ụlọikpe ahụ. Cheta na DSS nwuchiri nwa amadi a n'ọnwa Ogọstụ atọ mgbe ọkpọrọ oku ka ụmụ Naịjirịa mee ngagharịwe n'ụbọchị Ọgọstụ ise. N'Ọgọstụ asatọ, ka ọkaikpe Taiwo Taiwo nọ n'ụlọikpe dị n'Abuja nyere ohere ka DSS jide Sowore rue ụbọchị iri anọ n'ise. Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo? Ụlọrụ ọkaikpe kachasị na Naịjirịa (Office of Attorney general of the federeation) mechara kpụpụ Sowore maka ebubo ruru asaa gụnyere mpụ ego ,iji kọmpụta rụ ala nakwa imegide obodo. Ka ọkaiwu Sowore bụ Femi Falana rịọchara ọkaikpe Taiwo Taiwo ka ọ tọghapụ ya, ụlọikpe kwetere ma kwuo ka ọ wete akwụkwọ ikike njem ya. Mana ka otu izu ụka gachara, ụlọọrụ DSS atọghapụbeghị nwa amadị a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45207599,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45207599,Lee onye Igbo na-ekwuchitere ụlọọrụ DSS ọnụ ọhụrụ,Aha ndị DSS anaghị atọcha ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ụtọ maka mkpa mkpa ha na-akpawa n'obodo a.,"Ndị DSS na-akpa mkpa mkpa na Naịjirịa Mana ndị Igbo nwekwara ike ị ṅụrị ọnụ n'ozi a na-ekwu na ahọpụta nwafọ Igbo dika onye ga na-ekwuchitere ndị DSS ọnụ. Ha kpọpụtara aha nwoke ahụ dika Mazi Nnọchirionye Afunanya. Akwụkwọ ozi ha depụtara goziri na Afuanya gụrụ asụsụ Bekee na Mahadum Abia steeti nakwa Mahadum Uyo. Ha depụtara na Afuanya turu ugo mmụta n'ihe na agụmaakwụkwọ gbasara iweta udo na nhazi Obodo na Mahadum Ilorin. Ụgbua Afunanya na-agụ ihe mmụta dọkịta na Mahadum Nasarawa. Ọ gụkwara akwụkwọ gbasara ntaakụkọ na nhazighari Obodo na Mahadum dị na mba ofesi. Afunanya bụ onye otu ''Nigeria institute of Chartered Arbitrators, Nigerian Red Cross na Nigerian Institute of Management.'' Akụkọ na-ekwu na Afuanya ga-anọchite anya Tony Opuiyo onye ụfọdụ na-ekwu na ahụtụbeghị ya anya mbụ. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara nhọpụta Afunanya n'igwe soshal midia. @emma_evwaraye na-ajụ ma onye ọhụrụ a ga-anọnwụ n'oche ahụ? @Ejimtrix kwuru si na-emere nhọpụta a n'oge ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC wee were Afunanya mezue ebum n'obi ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-49275690,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49275690,Latest Transfer News: Ebe 'ikuku' bugara ndị Nigeria na-agba bọọlụ na mba ofesi,"Dịka ndị egwuregwu bọọlụ na-achọ ịmalite afọ ọhụrụ nke 2019/2020, ụfọdụ ndị Naịjirịa esila n'otu ha gafee ọzọ.","Ka ahịa ọzụzụ na orire nke English Premier League mechiri n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ndị mmadụ chọrọ ịma ebe ndị Naịjirịa na-agba bọọlụ na mba ofesi nọ. Ma ndị si otu mba gafee mba ọzọ, na ndị si n'otu egwuregwu dị na mba ha nọbụ banye n'ọzọ, BBC Igbo ga-agba ha n'anwụ n'akụkọ a. Lee ndị pụrụ na ebe ha gara: Alexander Iwobi Iwobi so Naịjirịa gbaa asọmpi Iko Mba Afrịka ma nweta ọlanchara, si Arsenal ebe ọ gbara ihe karịrị afọ atọ na ụma gafee Everton ebe a kwụrụ nde paụnd 40 iji zụrụ ya. John Mikel Obi Obi wụsarala ọwa n'ịgbara Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ, si otu Middlesborough dị na mba Ịngland gafee otu egwuregwu Trabzonspor dị na mba Turkey oge a na-agba Iko Mba Afrịka nke 2019. Kenneth Omeruo Omeruo malitere ịza onye Chelsea kemgbe ha zụtara ya n'afọ 2012 mana ọ gbaghị otu mkpụrụ bọọlụ n'uwe Chelsea. Akụkọ si n'akwụkwọ mgbasaozi Marca na-ekwu na Chelsea na CD Leganes bụ ebe Chelsea binyere ya n'afọ gara aga, ekpebiela ire ya n'ọnụ Yuro ise. Taiwo Awoniyi Awoniyi so n'otu egwuregwu nọbu na Liverpool ebe ọ na-agbaraghị ha bọolụ maọlị wee gafee FSV Mainz 05 dị na mba Jamini na mbinye. Chima Akas Akas wuru ewu maka ịnọchite anya Naịjirịa nakwa ime ọfụma n'asọmpi Africa Nations Championship (CHAN), si Kalmar dị n'obodo Swidin gafee C.F. Os Belenenses dị na mba Pọtugal. Sodiq Fatai Fatai si FC Paços de Ferreira gafee Chaves dịkwa na mba Pọtugal na mbinye. Bright Enobakhare Enobakhare nọbu Wolverhampton FC si ebe ahụ gafee Wigan Athletic na mbinye. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-48457616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48457616,Fada Festus Ezeamaka ekwuola na ọ bụ ndị na-amanye 'sit-at-home' wakporo ya,Ukọchukwu Festus Ezeamaka bụ fada na-edu ụka katọlịk nke Saint Jude Nnewichi dị na Nnewi agwala BBC Igbo na ọ bụ ndị ntoroọbịa na-amanye ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị Mee 30 nke 2019 wakporo ya ka ọ na-aga ekpere ụtụtụ.,"Ihe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya. Ụkọchukwu Ezeamaka nọ n'ụlọgwụ Nnamdị Adikiwe na Nnewi anata ọgwụgwọ si na ndị a wakporo ya jụrụ ya ihe mere ojiri pụta ubọchi amachiri ngagharị. ""Ha jụrụ ma m che na ha na-egwu egwu mgbe ha si ka ndị mmadụ apụtaghị."" Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu: Okwu Ụkọchukwu Ezeamaka gwara BBC kwadoro okwu onyeisi ngalaba na-ahu maka nchekwa na ""Diocese"" Katọlịk nke Nnewi bụ Ụkọchukwu Christopher Nwobi gwara BBC Igbo. Ụkọchukwu Nwobi sị na Ụkọchukwu Festus Ezeamaka nọ n'ụzọ ịga kpee ụka ụtụtụ mgbe o zutere ndị a na-eche na ha bụ Ipob na-agụ egwu na-akpagharị na mpaghara Ibeto Junction. Ụkọchukwu Nwobi kwukwara na a maghị ihe kpalitere ndị a, dịka Ezeamaka yi uwe ndị ụkọchukwu ma nwekwa ihe ngosi na ọ bụ ukọchukwu n'ụgbọala ya. A kuriri ụgbọala Ụkọchukwu Ezeamaka bu ma merụọ ya ezigbote ahụ. Nwobi sị na Ezeamaka kara ahụ nyara ụgbọala ya ruo ụlọụka ya, ebe ndị ụka si buru ya gbagawa ụloọgwụ nkụzi nke Nnamdi Azikwe, bu ebe ọ nọ ugbua. Gee onu Ụkọchukwu Nwobi n'ujuebe a: Okwu Fada Nwobi Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra bụ Mohammed Haruna gwara BBC Igbo na onweghi nsogbu ọbụla so emume sit-at-home ya ma maka ya, ma ga n'ihu kwuo na nke a nwereike bụ maka eziteghị uweojii ozi. Mana Ụkọchukwu Nwobi kwuru na ụlọụka Ezeamaka gbara ama ihe mere n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Otolo Nnewi. Ọ si na ndị uweojii sị ka ụkọchukwu ahụ awakporo bịa ma ọ natacha ọgwụgwọ. Na soshal midia, ndị mmadụ wepụtara ihe onyonyo na-egosi ụgbọala ha kwuru bụ nke ụkọchukwu a awakporo. Akụwasịrị ụgbọala a, dịka ọbara metọsịri ime ya. Ụlọ ntaakụkọ Punch buburu akụkọ na a na-eche na mmadụ ise nwụrụ mgbe ndị ụka na ndị Ipob lụrụ ọgụ, mana Ụkọchukwu Nwobi sị na o nweghị ihe dị etu a mere. Ubọchi Mee 30 bụ oge ọtụtụ ndị mmadụ ji echeta ụbọchi ahụ n'afọ 1967 Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu hibere mba a kpọrọ, Biafra. Ipob na ụfọdụ otu na-achọ ka ekepụta Biafra na Naịjirịa na-akpọkarị oku ka ndị mmadu nọdụ n'ụlọ n'ụbọchị ahụ. Lee etu BBC Igbo si gbasa ozi banyere ịnọdụ n'ụlo nke 2019 ebe a:" afirika-53281803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53281803,Rape in Nigeria: Etu nwaanyị a wakporo n'ike si mụọ ejima atọ n'Imo,Nwaanyị mụrụ ejima atọ n'Imo steeti atụọla ọtụtụ mmadụ akpata oyi.,"Etu ị ga-eme ka 'prostate' gị na-achị sọ ọchị Ihe kpatara nke a bụ na ọ bụ mwakpo ka otu ofeke wakporo Nkechinyere Ezenwa wee tụwa ya ime. Nkechinyere kọọrọ BBC Igbo etu ya bụ ihe si mee oge ọ na-ebugharị unere (banana) n'Owere. O kwuru sị: ""Otu nwoke kpọrọ m ka m bịa resị ya ahịa n'otu ụlọ arụchabeghị arụcha."" Ụmụ ejima atọ Nkechinyere mụrụ n'ime ụbọchị atọ ""M wee gaa ebe ahụ, ọ wakpo m n'ike."" ""O nweghị onye gwara."" ""Mgbe m chọpụtara na-adị m ime, a gaghachiri m ebe ahụ, mana ahụzighi m nwoke ahụ."" Nkechinyere , onye kwuru na ọ bụ naanị nne ya ka ọ gwara ihe mere sị, ""Amaghịkwanụ m onye ọ bụ."" Mwakpo ụmụnwaanyị Nkechinyere kwuru na ọ mụrụ ụmụ ejima atọ ahụ n'ime abalị atọ. N'ụbọchị 17nke ọnwa June ka ime mewere ya ọ gaa n'ụlọọgwụ nta wee mụọ otu nwa. O kwuru sị: ""Onye nọọsụ ahụ gwara m na nwa nke ọzọ anwụọla n'ime afọ m. Ka anyị gaa nnukwu ụlọọgwụ ka e wepụ ya."" ""Mgbe anyị gara ụlọọgwụ mee nnyoch, a chọpụtara na ụmụaka abụọ ka nọ n'ime afọ m. Ha abụọ dịcha ndụ."" Nkechinyere ka nọ n'ụlọọgwụ ugbua maka na ụmụ ya ka nọ na 'incubator' Ndị ụlọọgwụ wara Nkechinyere afọ wee kupụta ejima abụọ nke fọrọ afọ. Ha atọ nọ na igwe ebe a na-etinye ụmụaka akabeghi aka nke bekee na-akpọ 'incubator'. Nkechi kwuru na ụgwọ ụlọọgwụ ha ruru otu narị puku naịra (N100,000). Ha ka nọ n'ụlọọgwụ ahụ ugbua." afirika-49328772,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49328772,East security: Kutuo ọgba na nkọrọ dị n'ọhịa Agwu - Gọvanọ Ugwuanyi,Dịka okwu nchekwa na-aga n'ihu aka na-achị Enugwu steeti bụ Govanọ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka a kutuo ma sụchapụ ọhia dị n'Agwụ.,"O kwuru nke a mgbe ọ gara inyocha ọwa ebe ndị ntọrị na-ezo ma na-esi eri mpọmpọ ọsọ nke dị n'okporoụzọ Enugwu-Pọt Hakụt nke ụmụogbua dị n'okpụrụọchichị Agwụ. 'Sụchapụ ohia gbara ọwa a gburugburu' - Gọvanọ Ugwuanyi Gọvanọ Ugwuanyi gakwara n'ime ohia Ihe-Agbogugu-Ogbaku-Amuri na Isu-Awaa-Agbudu ebe o nyere iwu ka akwatucha ọgba niile dị n'ohia a. Ugwuanyi ga kwara nyocha n'ebe a na aru ogige obibi ndị agha ndke dịkwa n'okporo ụzọ Enugwu-Pọt Hakụt, na ụmụogbua dị n'okpụrụ ọchichị Ọgwụ Gọvanọ Ugwuanyi gosiri njikere ya ikwusi mkpamkpa ndị ntọrị na ndị omekome ọzọ Ndị so mee njem a bụ onyeisioche okpuruọchịchị Agwu bụ Stanley Okeke na ndị na-anọchite anya mpaghara ""North and South"" nke Agwu bụ Jane Eneh na Johnson Chukwuobasi. Ugwu anyị kwuru na ndi uweojii na ndịagha ga-amalite ọrụ nchekwa na mpaghara a iji kwalite nchekwa ndị mmadụ. Gọvanọ Ugwuanyi gakwara nyocha ogige ndị agha a na-arụ. Cheta na ọ bụ n'Enugwu Steeti ka ndị ntọri tọrọ Igwe Sunday Orji bụ Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu ma mechaa tọhapụ ya. Enugwu steeti ga kwara n'ihu hiwe ngalaba nchekwa ọhia a kporo ""Forest Rangers"" n'olu Bekee maka nchekwa ndị ime ọbodo. Lee Akụkọ Ga-Amasị gị Lee Ihe Nkịri a 'Ihe na-agbata m n'uche bú maóbú etu ka m ga-esi laa' - Onye ndị ntọrị nwụchịrị" egwuregwu-47969601,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47969601,Man City vs Tottenham: Mmiri eriela Man City n'azụ ụlọ ha,Goolu zoro ka mmiri mgbe Man City na Tottenham kwasuru ya n'ọgbọ egwuregwu Etihad n'asọmpi Champịọns League.,"Raheem Sterling nke Man City ji igodo gbape ọnụ ụzọ goolu na nkeji anọ asọmpi a malitere. Ngwa ngwa ahụ Heung-Min Son nke Tottenham gosiri Man City nke tọrọ Bịati n'ịsụnye goolu abụọ na nkeji asaa nakwa nkeji iri. N'ime otu nkeji nke a mechara Man City mere ka ndị tetara n'ụra mgbe Bernado Silva na Raheem nyere goolu na nkeji iri na otu na nke iri abụọ na otu. Nke a mere ọkpụ goolu ise a na-enye n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a n'ime nkeji iri abụọ na otu. N'agba nke abụọ n'ime asọmpi a Sergio Aguero wụbatara dịka nwa agụ akpara aka n'ọdụ ma nye goolu nke na nkeji iri ise na itoolu. Otu abụọ ndị a kere nkwụcha ọtụtụ oge rue mgbe Fernando Llorente ji ukwu ya nye goolu na nkeji 73 mana enyochara n'ihe onyonyo tupu agụnye ya dịka goolu. Nke gbawara ndị Man City obi karịa bụ mgbe agụpụrụ goolu Sterling nyere ma kwuo na ọ nọ ""Offside"" site n'onyonyo ""VAR"". Agbanyeghi na Man City gbara Tottenham ọkpụ anọ asatara atọ, Tottenham gara n'ihu merie n'ihi goolu ha nyere n'ụlọ ndị Man City. Mmeri a bụ nke mbụ Tottenham na-eru agba ọkara ikpeazụ asọmpi Uefa Champịọns League. Tottenham ga-ezute Ajax ebe Liverpool na Barcelona ga-achịpụya n'agba ọkara ikpeazọ asọmpi a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46314758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46314758,Black Friday: Kedụ ka Black Friday si bido?,"N'agbanyeghị na o ruola afọ ole na ole ndị mba ọzọ malitere ime azụmahịa ""Black Friday"", ọhụrụ a ka o bidoro ịdọ ndị Naịjirịa n'ahụ.","Ka o sila dị, gị maọbụ onye ị ma nwere mmasị ịzụ ahịa na ""Cyber Monday"" nakwa ""Black Friday"", mana ị ma ihe ọ pụtara? Gịnị bụ ""Black Friday""? Emume a malitere na mba Amerịka, bụ ụbọchị na-eso ụbọchị ""ekele"" a na-eme na Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba kwa afọ. A na-ahụta ya dịka mmalite oge ndị mmadụ na-eji azụ ahịa ha ruo oge ekeresimesi, ndị na-ere ihe na-ejikwa ya arata ndị mmadụ n'ahịa ha. Ebe ndị mmadụ kwụ na-eche ka enyochaa ihe ha zụrụ tupu ha akwụọ ụgwọ, n'otu ụlọahịa dị n'Owere Mana ya bụ ""Black Friday"" na-ere isi abụọ; Otu, i nwere ohere iji aka gị họpụta ma zụrụ ihe ị chọrọ ịzụ mana nke abụọ bụ na ị laruo maọbụ ị zụchaa, ị nwereike ịhụ na ị zụtara ma ihe ị chọrọ ma nke ị na-achọghị. Maka gịnị? Makana ihe bịara dị ọnụ ala, ị na-azụ etu masịrị gị maka na ị che na ego pere mpe nke bụ na ị ga-ejinwu obere ego zụta ọtụtụ ihe. Ihe mere o ji amasị ndị mmadụ Ọ na-amasị ndị mmadụ nke ukwu makana ụbọchị ahụ na-abịakarị otu ugboro n'ime otu afọ, na-enye ha ohere ịzụta ọtụtụ ihe na-etufughị nnukwu ego. Ị gaa na mba ofesi, ị ga-ahụ ka ọtụtụ ndị bu oche nọrọ ala maọbụ kwụrụ n'ahịrị n'ihu ụlọahịa dị iche iche, ebe ha na-eche ka ụlọahịa ndị a mepee ka ha nwee ike kwobanye gaa rie ego ha. N'otu ụlọahịa dị n'Owere, ndị mmadụ pụtara tupu ahịa ahụ emepee, ka ha na-eche ịzụ ahịa ""Black Friday"" Ụfọdụ na-ebido n'abalị chi ga-efo ụbọchị ahụ, ka nwee ike ịbụ ndị mbụ ga-abanye. 1) Mbelata ego: Ọtụtụ ndị na-ewepụcha ihe ruru pasentị 70 N'ụbọchị ""Black Friday"", ndị na-ere ahịa na-ebelata ego, mee ka ihe ha na-ere dị oke ọnụ ala, bụ ihe Bekee kpọrọ ""discount"". Atụmatụ a bụ ụzọ ha na-esi enweta ndị ahịa ọhụrụ, makana ndị amabughị maka ha maọbụ ndị anaghị azụbu ha ahịa ga-ejiri ohere ihe ịdị ọnụ ala bịa na nke ha ma zụta ihe etu ha chọrọ. 2) Ọnọdụ ahịa nọ: Ebe ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịga ebe a na-ere ihe nke Bekee kpọrọ ""shopping mall"", ọ na-amasị ndị ọzọ ịzụ ahịa nke ha n'elu ịntanetị. Maka ọnọdụ ""ahịa"" a, o meela ka ọtụtụ ndị nweta ohere ịnọ ebe ọbụla ha nọ zụọ ọtụtụ ihe ha chọrọ. Ebe o si ka mma bụ na ị nwere ike ime ya n'elu ekwentị gị. 3) Izipụ ngwaahịa n'efu: Nke a na-aka adabara ndị na-azụ ahịa ""Black Friday"" nke ha n'elu ịntanetị. Nke bụ na ha tụkọtachaa ihe ha zụrụ, kwụọ ụgwọ, ndị nwe ahịa ahụ ga-ezite ya ebe ha nọ n'efu. Ị na-azụ ahịa ""Black Friday""? Gwa anyị etu o si amasị gị. Gịnị bụ ""Cyber Monday""? Nke a bụ ụbọchị Mọnde na-esote ụbọchị Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba, mgbe e mechara ""ekele"" na mba Amerịka. Ọ na-abịakarị ma e mechaa ""Black Friday"", ka ndị mmadụ nwee ike zụrụ ihe n'ọnụ ala na-aga n'ihu. Ọ malitere n'afọ 2005 na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44449828,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44449828,Lee ndị mụrụ ndị Super Eagles ebe a,"Ụwa niile jugodu gị, ọ ga-ara ahụ nne na nna gị ịhapụ gị. Ndị otu Super Eagles ma nke a, ya mere ha ji a naghị eji ndị mụrụ ha egwu egwu.","Onazi na nne na nna ya Site na ndụmọdụ mmadụ nwere ike inye onye ọ hụrụ n'anya, ndị mụrụ ndị Super Eagles akwadola ha n'ụzọ pụrụ iche mere ha ji nwee ike ịnọchite anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu bọọlụ. Ị hụtụla nne na nna mụrụ ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ a? BBC Igbo ga-egosi gi ha. Ngwa gụrụ gbadaa. Kenneth Omeruo Nne na nna Omeruo bụ ""ihe niile"" nye ya. Ụjọ anaghị atụ ya igosi nke a. N'ụbọchị ndị nne nke afọ 2018 a, Omeruo gonyere nne ya ụgbọala iji gosi ya ịhụnanya o nwere ebe ọ nọ. Elderson Echiejile Echiejile anaghị eji nne ya egwu egwu. O kwuru sị ""okwu nkịtị ezughị ịkọwacha ya...A hụrụ m gị n'anya"". Leon Balogun Nne na nna Balogun mụtara ụmụ atọ (nwoke abụọ na otu nwaanyị) nke Leon bụ nwa nke abụọ. Nna ya bụ onye Naịjirịa ebe nne ya bụ onye Jamini. A mụrụ Balogun na Jamini ebe o tokwara. Bryan Idowu Nna Idowu bụ onye Naịjirịa, bụ onye Yoruba. Nne nne ya bụ onye Rọshịa, ebe nna nne ya bụ onye Naịjirịa si ala Igbo. Idowu na-asụkwa asụsụ ndị Rọshịa ọfụma. John Ogu Ogu na nne ya yiri onwe ha ọfụma. Ọ naghịkwa eji nne ya egwu egwu. O kwuru na nne ya bụ 'ndụ' ya. Nna ya bụkwa ezigbo enyi ya. Abdullahi Shehu Naanị nne Shehu bụ onye o nwere ugbua makana nna ya nwụrụ n'afọ 2015. Wilfred Ndidi Ndidi anaghị eji nne ya egwu egwu, mana ndị ọzọ ọ naghị eji egwu egwu bụ Theo van Vlierden na nwunye ya bụ Marleen. Ha bụ ndị o jiri mere nne na nna site n'oge ọ gafere mba Beljiụm oge ọ dị afọ 17. Oghenekaro Etebo Etebo kwuru na nne ya bụ nne kachasị mma n'ụwa niile. O jighi nne ya egwu egwu. Odion Ighalo Ighalo na nne ya yiri onwe ha. Nna ya nwụrụ n'afọ 2016. Ahmed Musa Musa kwuru na enweghị onye dị ka nne ya n'ụwa. Ọ naghị eji nne ya egwu egwu. Nna ya nwụrụ oge o bụ nwatakịrị. Alexander Iwobi Nna Iwobi na Austin Okocha bụ nwanne. Ịgba bọọlụ ọ dị n'ọbara ha? Enweghị ihe dị ka nne na nna na ndụ mmadụ. Ị kwenyere na nke a?" 50078884,https://www.bbc.com/igbo/50078884,Man United vs Liverpool: Ndị Man Utd a ga-atụpụrụ Jurgen Klopp ọnụ?,Ndị Man Utd unu a ga-eyiri ọbante jee ọgụ?,"Liverpool ji pọintị asatọ aga Manchester City bụ ndị nọ n'ogogo abụọ na tebulu Premier League Aka na-achịkọta Liverpool bụ Jurgen Klopp na-agba egbe ọnụ maka ihe ọ na-eche na ndị otu ya ga-eme Man Utd n'ụbọchị ụka. Klopp kwuru na ya ma na ndị Man Utd na-ekwu okwu igbanwe ọnọdụ ha, mana ọ sị ha cheretukwuo otu izu (ka ha kụzichaara ha ihe) tupu ha amalite ya bụ mgbanwe. O kwukwara na ""echeghị m na e nwere ọtụtụ otu egwuregwu ga-achọ izute anyị ka ọ dị ugbua"". Ma sị "" Man Utd nọ n'ọnọdụ na-amasịghị ha, ha chọkwaranụ ịgbanwe ya. Anyị ga-agba mbọ ịhụ na mgbanwe ahụ ha na-achọ ga-amalite n'izu na-abịa nụ (mgbe anyị zutechara). Ọ gwụchaa!"" A chụọla osote gọvanọ Kogi steeti ụkwụ eru ala Simon Achuba ga-anọ n'ịta ikikere eze ugbua dịka ndị ụlọomeiwu steeti ya gbakọrọ aka chụtuo ya n'oche. Ha boro ya ebubo agwa ọjọọ nakwa ihe ndị ọzọ. Cheta na Achuba na Gọvanọ steeti ya na-ese okwu kemgbe. Ebee ka nwoke a ga-esi bido ebido? Otu nwoke nọ eche ụwa ya ugbua ka ọkụ Ọchanja napụrụ ya ụlọahịa ya, nke gbara n'Ọmọba anapụ ya ụlọobibi ya nakwa ụgbọala ya. Ọkụ malitere ịgba n'Ọmọba ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ ụbọchị 18 nke ọnwa Ọktoba 2019 N'agbanyeghị na mmadụ anwụghị na nke Ọmọba, ụzụ akwa na-atụ n'ihi na ụlọ na ụgbọala gbachara ọkụ. N'isi ụtụtụ, ndị bi n'Ọmọba Ọnịcha tetara ụra n'elekere atọ nke isi ụtụtụ dịka tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsasịa ihe o bụ n'ala. Ya bụ mmanụ ghọrọ ọkụ dị ka nke Ọchanja siri mee. Lee ihe ndị mmadụ gabigara n'ọkụ abụọ gbara n'Ọnịcha n'otu izu. Ogbunigwe alaala ndị mmadụ n'iyi n'Afganịstan Ogbunigwe a gbapụrụ na mpaghara Nangarhar Province Ihe karịrị mmadụ iri isii anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ dịka ogbunigwe gbapụrụ n'ụlọekpere alakụba na mba Afganịstan taa. E nwebeghi ndị kwere na ọ bụ n'aka ha ka mwakpo ọjọọ a si. Ndị Shiite aghaala ike n'anwụ ọzọ Akụkọ si Abuja eru anyị ntị na-ekwu na ndị uweojii ji anwụrụ ose wee chụsasịa ndị otu Alakụba a kpọrọ Shiite mgba ha mere ngagharị iwe n'ehihie taa. Ndị otu Shiite ka na-akpọ oku ka a tọhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky nke gọọmentị etiti ji kamgbe afọ 2015. Ndị ọrụ na gọọmentị achabiela ehi ọdụ Ebe ndị ọrụ na gọọmenti na-etinyeaka n'akwụkwọ maka ụgwọọnwa ha N'ikpeazụ nghọtaghie dị n'etiti ndị ọrụ na gọọmentị etiti abịala na njedebe dịka ha nwere nkwekọrịta na ya. Dịka nzuko ha nọ na-aga n'ihu, mịnịsta steeti na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Festus Keyamo dere ya n'akara Twitter. O dere ""Site na mkparịta ụka gọọmentị na ndị ọrụ, ha ekwekọrịtala na nhazigharị puku naịra iri atọ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ."" Onyeisi otu a kpọrọ 'Trade Union Congress' bụ Quadri na odeakwụkwọ ya bụ Musa-Lawal Ozigi sị na nke a bụ eziokwu. Ha kelere gọọmentị na ndị ọrụ maka inwe ndidi na mkparịta ụka ha iji nwe nkwekọrịta. A ga-eji pasentị 23.2 bulie ego ndị nọ n'ogogo 7, pasentị 20 n'ogogo 8, pasentị 19 n'ogogo 9. Pasentị 16 maka ndị nọ n'ogogo 10 ruo 14, pasentị 14 na ndị n'ogogo 15 ruo 17. Nkwekọrịta ha na-abịa dịka ụbọchị otu narị na iri asatọ na abụọ gachara onyesiala Buhari tinyere aka na ya. Ụgbọala Tanka ọzọ agbaala ọkụ n'Ọmọba Ọnịcha Nwanna ọkụ a gbara n'Ọnicha ka bụkwa okwu akpụ n'ọnụ dịka ọtụtụ ihe onyonyo na-apụta na soshal midia. Dịka a na-ekwu nke a, ụgbọala Tanka ọzọ dara ma gbaa ọkụ n'okporoụzọ Ọmaba Phase 1 nke Ọnịcha na mgbede ụnyaahụ. Mana ndị uweojii site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Haruna Mohammed sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara. Mohammed kwuru na ha ebupụla ụgbọala Tanka a n'ụzọ ka ọ ghara igute kpachi kpachi okporoụzọ. Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ sị na ọ bụ mposi ka eji gbanyụọ ọkụ ebe ụfọdị ebe ndị ọrụ gbata gbat enweghị mmiri. Idemmiri emeela ndị mmadụ ịwa na Gana Ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihi oke mmiri ozuzu zoro ụbọchị asatọ na Gana Ihe karịrị ụlọ otu puku alariela n'iyi, mana n'agbanyeghi nke a egwu ka dị na ọnụọgụgụ ndị o metụtara ka ga-arị elu. Ed Woodward enweela iwe Ed Woodward bụ onye nọ n'aka ekpe Onyeisi otu egwu bọọlụ Manchester United bụ Ed Woodward sị na ọ bụ mkparị ị sị na ndị na-abụghị ndị boolu na-eme mkpebi n'ihe gbasara bọọlụ. Cheta na a sị na Woodward na-etinyekarị anya n'okwu ndị nchịkọta Man United. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkriri Coscharis Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45656879,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45656879,Imo Steeti: Ihe kpatara anyị ji gbagharịa Madumere akwụkwọ,Gọọmenti Imo steeti ekwuola ihe mere ha ji aga ụlọikpe mkpegharị ịgbagha mkpebi e kpebiri iweghachite Eze Madumere dịka osote gọvanọ steeti ahụ.,"Eze Madumere na Okorocha anaghị esi otu ụzọ agafe Onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo, kwuru na ụlọikpe ahụ arụtụghị aka n'ebubo e boro Madumere e jiri chutuo ya kama ọkaikpe metụrụ aka naanị na ndị e kpokobara mere nyocha maka nchutu ahụ. O kwuru na Okorocha enweghị ihe ọbụla o nwere megide Madumere maọbụ ọkaikpe kpere ikpe ahụ, kama na ọ bụ usoro iwu ka ha na-eso. N'okwu ya; ""Ọkaikpe ahụ kwuru na onyeisi oche kọmiti mere nyocha ebubo e boro Eze Madumere gafere oge e nyere mana o kwughị okwu gbasara ebubo e boro Madumere."" ""Ndị na-eme mkpegharị a bụ ndị ikpe ahụ metụtara, gọvanọ Okorocha esoghị na ya."" Sam Onwuemedo Cheta na ụlọikpe kpebiri na iwu akwadoghi usoro e jiri chutuo Madumere wee nye iwu ka ọ lọghachi n'ọrụ. Eze Madumere gwara BBC Igbo ụnyaahụ na ya alaghachila azụ n'ụlọọrụ ya dịka osote gọvanọ. Cheta na otu ụlọikpe n'Owere n'ụbọchị 25 nke Septemba 2018, kpebiri na iwu Naijirịa akwadoghi nchụda ndị ụlọomeiwu chụdara ya n'ọnwa Julaị nke afọ a. Madumere gwara onye ntaakụkọ BBC na mkpebi pụtara n'ụlọikpe bụ naanị olileanya ndị nkịtị nwere n'ala Naịjirịa. N'ọnụ okwu ya: ""Anyị na-ebuso emume ịmaja mmadụ agha, mana olileanya m nwere n'aka chukwu nakwa iwu ala Naịjirịa butere mmeri a."" Madumere kwukwara na ọ na-ekele ndị Imo maka mmeri a makana ha so n'agha a butere mmeri a. Ọ ga-ebute udo? Kemgbe mkpebi a pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwuputa uche ha gbasara yabụ mkpebi. Okorocha ọ ga-anabata ya? Mmadụ dịka @PrincessChi jụrụ ajụjụ na Twitter sị na nsogbu maliteren'ihi okwu a ọgwụla? Onye ọzọ bụ @Buchyogba jụrụ ajụjụ nke ya sị ma Okorocha ọ ga-anabata Madumere n'udo dịka osote ya? Isi mbido nsogbu Madumere na Okorocha Ọ bụ kemgbe Madumere gosiri ebumnuche ya iso zọọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Imo steeti ka okwu a malitere. Cheta na gọvanọ Rochas Okorocha chụrụ kọmịshọna iri na atọ n'ime ọnwa a makana ha chọrọ ịzọ ọkwa dị iche iche n'Imo steeti. Madumere gwara BBC Igbo mgbe ahụ na ebumnuche Okorocha bụ na onye ọbula chọrọ ịzọ ọkwa ọbụla kwesịrị iritu n'ọkwa o ji ugbua. Akụkọ ga-amasị gị Osun Rerun: Falae si na SDP esoghi na mkpebi Omisore Nzụkọ gọọmentị na NLC amịtaghị mkpụrụ, abụbọ ọrụ ga-amalite taa" 43041242,https://www.bbc.com/igbo/43041242,Ndị ọka mara na Bauchi ekewala ejima abụọ,Ejima abụọ nyadoro onwe ha adịrị la mgbe ndị dọkita wara ha ahụ ka ha nweike biri ịcheiche.,"Nke nwoke n'ime ụmụ ejima ahụ nwụrụ anwụ {ma ọbụghị ndị no na foto a] Akụkọ kwụrụ na dọkịta asaa na ndị ọrụ ụlọọgwụ ndị ọzọ gbara mgbọ oge ruru elekere abụọ were mee ihe nke a. Ndị ọrụ ụlọọgwụ kwuru na ejima nke nwoke nwụrụ na ọwụwa ahụ nke a mana ejima nke nwaanyị dị ndụ na-anara ọgwụgwọ. Amụrụ ụmụ ejima ahụ n'ọnwa Disemba n'afọ gara aga, n'ụlọ ọgwụ n'obodo Chanka na Alkaleri, Bauchi steeti. Nne ụmụaka ahụ dị afọ iri abụọ mgbe ọ mụrụ ha, Ọ sịkwa n'otu n'ime ha abụọ anaghị eku ume n'oge omumu ha. Onyeisi ụlọ omeiwu nke nta bu Yakubu Dọgara bụ onye kwụrụ ụgwọ ọwụwa ahụ nke a maka ịnyere nke dị ndụ biri." media-48080631,https://www.bbc.com/igbo/media-48080631,Computer village protest: Anyị achoghị nne ukwu na nna ukwu n'ahịa anyị,Ndị na-azụ ahịa na Kọmpụta vileji nke Legọs akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị anabata Iyalọja na Babaloja bụ nke achọrọ ịtụkwasị ha n'isi dịka omenala ndị Yoruba si dị.,"Ndị ọrụ kọmputa sị na ha achọghị Iyaloja Onyeisi ndị otu ahịa ahụ bụ Ahmed Ojikutu bụ ndị kpọrọ onwe ha Allied Products Dealers Association of Nigeria (CAPDAN) kwuru nke a ụnyaahụ mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu. Ndị na-azụ ahịa mere ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde iji gosi iwe ha ma rịọ ndị Naịjirịa niile ka ha ekwela ka amanye ha mama ukwu na papa ukwu n'ime ahịa ha. Onye bụ Iyalọja? Iyalọja bụ nwaanyị onyeisi ahịa dịka ụmụnwaanyị ahịa siri họpụta. Dịka ọkammụta n'asụsụs Bisoye Elesin siri gwa BBC, ọ bụ Oba obodo ka o ruru ịhọpụta onye bụ Iyalọja. O kwuru na ọ bụ omenala ịhọpụta onye na-azụ ahịa ebe ahụ ma sorokwa kwalite ahịa ahụ. Elesin kwuru na ọ nwereike ọ gaghị enwe isi maọbụrụ na ahọpụta Iyalọja n'ahịa ebe e nwere ndị si n'agbụrụ dị icheiche. May Day Taa bụ ụbọchị enwepụtara maka ịja ndị ọrụ ike n'ụwa gbaa gburugburu bụkwa ụbọchị ezumike ndị ọrụ niile na Naịjirịa Odeakwụkwọ Nigeria Labour Congress bụ Peter Ozo-Eson ji ohere a kpọọ oku ka amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra iri atọ n'ọnwa Mee a. EFCC adọọla ndị Gọvanọ aka na ntị Magu kọwaputara ego ya ndị otu ya chọputara na arọ gara aga na Vienna. Onye nnọchite anya ụlọrụ Economic and Financial Crimes Commission arịọla ndị gọvanọ na-abata ọhụrụ na ndị ochie ha sepụ aka na ngarị na mpụ na mmalite ọrụ ahụrụ ha. Ibrahim Magu bụ onye kwuru nke a n'ọkpakọ ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị ochie sị na mpụ na ntọ bụ ihe kacha echere gọọmenti a aka mgba. Trump na Moslem Brotherhood Abdel Fattah al-Sisi na Trump N'ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na gọọmentị ya ga-etinye aha ndị Moslem Brotherhood nke Ijipt dị ka ndị Omekataraihepụụjọ. Trump kwuru nke a ụnyahụ mgbe onyeisi mba Ijipt bụ Abdel Fattah al-Sisi kpọtụrụ na obi ya bụ ebe ọ nọ kwuo na ọ ga-amachi ndị otu ahụ mmekọ gbasara njem na akụnaụba. Egwuruegwu, N'egwuruegwu, Ajax ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham n'asọmpi Uefa Champion's league ụnyaahụ. Goolu a si n'aka Donny van de Beek emeela ka Ajax manye otu ụkwụ n'agba ikpeazụ nke asọmpi a. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50231874,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50231874,Umuahia Landslide: Hapụnụ okirikiri ebe mbuze na-eme,"Gọọmentị Abia Steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ha hapụ okirikiri ebe ahụ mbuze loro ụlọ ndị mmadụ n'Amuzukwu-Ibeku, Umuahia.","Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Solomon Ogunji kwuru nke a oge ọ gara ebe ya bụ ihe mere n'ụbọchị Wenezde. Ogunji kwuru na ""Mbuze a abụghị nke oke ideimmiri kpatara."" ""Anyị nụrụ na ala mara jijiji, anwụrụ eju ebe niile tupu mbuze ahụ emee."" ""Ndụmọdụ anyị bụ ka ndị mmadụ si n'okirikiri ahụ pụgodu, ganye mgbe anyị ga-emecha nchọpụta ihe kpatara mbuze a."" N'akwụkwọ ozi ha zipuru ụbọchị Tọọzde, gọọmentị Abia kwuru na ihe ahụ mere abụghị mbuze nkịtị. Onye zipuru akwụkwọ ozi ahụ bụ Onyebuchi Ememanka, onyeisi mgbasa ozi nke Gọvanọ Okezie Ikpeazụ. Cheta na nnukwu mbuze kwaturu ụlọ ndị mmadụ n'Ibeku n'ime abalị Monde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọktoba. Dịka akụkọ ahụ si kwuo, obere ihe ka otu nwaanyị na nwa ọhụrụ ya ji gbanahụ ya bụ ọdachi. Nwaanyị ahụ kuru nwa ya gbapụta n'ezi oge ọ hụrụ na ụlọ ha na-ama jijiji. O teghị aka, o ku nwa ya gbapụta, ụlọ ha dakpuru n'ime ala. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ" afirika-44977604,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44977604,Buhari: Mbaka gwara Buhari: Ihe ndị mmadụ na-ekwu,Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu gbasara Fr. Mbaka na ihe ọ gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu o si achị Naịjirịa.,"Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 Ka Fr.Mbaka na-aka ụka ụbọchị ole na ole gara aga, o kwuru sị na ọchịchị Buhari adịghị mma maka na ọ bụ ""ọchịchị nchịgbu"". O kwukwara na Buhari anaghị eme ka onye nkwafu ọbara mmadụ na-emetụta n'ahụ. Nke a bịara dịka ihe mgbawojuanya nye ụfọdụ ndị mmadụ mere ha ji tinye ọnụ ikwu na ọ tụrụ ha n'anya na Mbaka kwadoburu Buhari nwere ike ịtụgharị kwuo ụdịrị okwu a. Ihe ndị mmadụ kwuru Ụfọdụ kwenyere n'ihe o kwuru, ebe ndị ọzọ na-ajụ ma ọ bụ ugbua ka o bidoro ịhụ ihe ha bidoro ikwu kemgbe. Ethelbert Ugwuegbe C kwuru sị ""Biko juo nwa Mbaka ma pigeon ya oka n'efekwa."" Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" Afunwa Elota Nna kwuru sị ""ịgwa gị eziokwu aghọtaghịzị m Mbaka, ọkwa yanwa gwara anyị na Buhari bụ onye nzọpụta, mana kịta o kwugharigo"". Chukwuemeka Kingsley Chinemeze Kwuru sị ""Mbaka na-ekwu okwu abụọ. Kedụzị nke anyị ga-eso?"" Omeh Chuks Godwin's Kwuru sị ""Nke a bụ eziokwu, mana Fr.Mbaka so tinye Nigeria na nsogbu a."" Maazi Chimaobi Amaefuna kwuru sị, ""Mbaka, anyị achọghị ndụmọdụ gị ọzọ. Nke mbụ i kwuru dobere Naijiria n'ọnọdụ ọ nọ ugbua mgbe ị gwara ndị mmadụ ka a tụnyere ""#Demon_cracy"". Lee ihe ndị ọzọ kwuru ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43396470,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43396470,Sevilla e kponyerala Man U aja na gari,Emeri gburu ndị otu egwu bọọlụ Manchester United maka mmeri Sevilla emeriri ha unyaahụ.,"Wissam Ben Yedder e nyela golụ asatọ na Champions League na-agba nke a Sevilla ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ụmụ Mourinho. Ọ tụrụ na anya ka mmeri ahụ sị bịa maka na ndị Manchester United ji ọgbọ mgbe amalitere ya bụ egwuruegwu ruo mgbe alọtachara ezumike. Ndị Sevilla webetara otu nwaamadị ukwu na-aghọ nkọ bụ Wissam Ben Yedder. Ya bụ onye a na-ekwu mere ihe eji kpọọ ya site na ịgbanye ọkpụ abụọ n'ọnụ goolu ndị Man U mgbe ọ dị nkeji 74 ebidochara ya bụ egwuruegwu. A na-ekwu ka a na-ekwu, o mezụọ ya ọkpụ abụọ ihe erughị nkejị ise o tinyechara nke mbụ. Anwụrụ malitere ịpụ ndị Man United na anya mgbe ahụ. Ha bidoro siwe ọnwụ, lụwa ọgụ ka nkịta ara. Mana nke ahụ bụ ụlụọnwụ ka ha na-alụ. Emerị mere ndị Man U unyahụ Ha tara ahụhụ nke ukwuu ịhụ n'ihere emeghi ha na be ha, bụ ebe a na-agba asọmpi a. Romelu Lukaku gbaara isi onwe ya site na-ịgbakpunye otu goolu n'ọnụ goolu ndị Sevilla na nkeji 84. Nke ahụ mere ka asọmpị ahụ kụrụ ọnụ na 2-1 mere e ji chụpụ Manchester United n'egwuruegwu nke Champions League mgbe ha sọgoro mpi 16 n'agba nke a. Manchester Unted na Tottenham ga-ala ezumike ebe ndị Manchester City na Liverpool ga-abanye agba nke anọ na Champions league. Chelsea nwere ike i soro ha maọbụrụ na ha merie asọmpị ha na ndị Barcelona n'ụbọchị taa. N'aka ọzọ ndị Roma jị otu ọkpụ merie ndị Shakhtar Donetsk. Dzeko tinyere ya bụ goolu ka anatachara ezumike. Ka ndị Shakhtar na-esi onwu ịsa ya bụ goolu, Ordets, onye otu ha gbatara mpempe akwụkwọ'red card' ejiri chụpụ ya n'egwuruegwu ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45756036,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45756036,2019 Election: Ọgụ na mgba chere Abịa steeti n'ihu,"Ndọrọndọrọ onye ga-abụ gọvanọ n'Abịa steeti n'afọ 2019, agaghị abụ ụkwa achị n'aka agba egwụ.","Nke a bụ n'ihi ndọrọndọrọ na-ebiri ọkụ dịka ndị ga-asọkọ mpị maka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ na ndị kwụ ha na azụ. Onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ọkaiwu Chima Nnaji kọwara n'ọ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n' Abia Steeti n'afọ 2019. Nkọwa ya gbakwasịrị ụkwụ na nhọpụta pati APC họpụtara Uche Ogah dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ nakwa pati PDP sịrị gọvanọ Okezie Ikpeazụ chịzuo afọ anọ ọzọ. BBC Igbo jụrụ Nnaji etu ọnọdụ ndọrọndọrọ n'Abia steeti nwere ike ịdị n'afọ 2019. O kwuru na ""ahịa ọma na-ere onwe ya"". Na ọ bụrụ na Gọvanọ Ekezie Ikpeazụ chịzie ndị Abia nke ọma na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara ịhọpụta ya ọzọ. O kwukwara na ndị Abia anụla ụtọ maọbụ ụfụ ọchịchị dị iche iche kama na ọ bụ ha ka ọ dị n'aka inwe mgbanwe. Nnaji rụtụrụ aka na mpụ na aghụghọ dị ntuliaka bụ ihe ọzọ nwerei ke ime ka ebumnobi ndị Abịa ghara imezu n'afọ 2019. N'ikpeazụ Nnaji dọrọ ndị Abia Steeti aka na ntị ka ha kee nkwụcha chekwa vootu ha n'afọ 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50520832,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50520832,Witchcraft Conference ga-aga n'ihu na mahadum na UNN,"Ọgbakọ mmụta ngalaba akọpọrọ ""B.I. Ijeomah Centre for Policy Studies and Research"" na-achọ ikpọkọba na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na-ewu ewu kemgbe maka ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya.","Ụfọdọ na-ekwu na ya bụ ọgbakọ ekwesighị ịpụta ihe maka na ọ bụ ọgbakọ ndị 'amusu'. Ndị ọzọ ka a nụrụ na ha achọghị ka ya bụ ọgbakọ pụta ihe maka na ọ nwereike ịgba agwa ndị amusu n'anwụ n'ụzọ ga-emebiri ha ihe. Nke dị na soshal midia kemgbe ụnyahụ bụ na ya bụ ọgbakọ akpụọla afọ n'ala. Mana nke ahụ bụ ezigbo asị dị ka otu onye ọkankuzi Nsukka so ekpokoba ya bụ ọgbakọ achọghị ka akpọ aha ya siri kwuo. Ọ sị na ya bụ ọgbakọ ka ga-amalite ụbọchị Wenezde ọzọ bụ 26 na 27 nke 2019 dịka akara ya. Ya bụ ọkankuzi sị na ""ọ bụ ndị amusu na-atụ egwu na ya bụ ọgbakọ ga-agba ha n'anwụ bụ ndị na-etinyere ha ọkpa n'azụ"". O kwukwara na ihe niile ahụ dị na soshal midia bụ okpokoto asi, ma sịkwa na ya bụ ọgbakọ ka ga-aga n'ihu. Chidi Ugwu bụ onye sokwa na kọmiti na-kpokoba ya bụ ọgbakọ sị na ya bụ ọgbakọ bụ maka ịme ka ndị mmadụ mata ihe gbasara amusu. N'onu Chidi, ""ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ amusu na-enye ha nsogbu ma ha nwee ọgbatughị ebụla"". Ọ sị na ọgbakọ a ga-eme ka ndị mmadụ ghọta nke bụ eziokwu. Agbanyeghị, Chidi sị na mahadum na-ekwu ka ndị na-ekpokoba ya bụ ọgbakọ kpatu aha ya bu ọgbakọ aka ka ndị mmadụ ghara ighọtahiezi ya. Chidi kwukwara na ọtụtụ mmadụ egosila masị na ịbịa ya bụ ọgbakọ nke bụ na ha ebugharịala ọnọdụ ebe a chọrọ ịme ya mbụ, bugazia ha ebe ga-abata ọtụtụ mmadụ. Lee ihe nkiri a Night runners: 'Ịta amusu dị n'agbụrụ ezinaụlọ anyị' Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46554520,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46554520,Parliamentary system of Government: Ihe dị iche n'etiti ya na nke Presidential,Ihe ruru ndị omeiwu iri abụọ na abuọ akpọọla oku ga-agbanwe usoro ọchịchị ala Naịjirịa ka ọ bụrụ 'Parliamentary system'.,"Iwe ha bụ na ụsoro ịnwe onyeisiala na-erị oke ego nakwa na ọ naghị enye ụmụ Naịjirịa ụdịrị ọchịchị ziri ezi. Otu onye ọkachamara bụ Ugochukwu Egbujo tinyere ọnụ n'okwu na-akọwa na ego a na-emefu n'ọchịchị ga-ebelata. Ihe dị ịche n'etiti ụsoro ọchịchị Presidential na nke Parliamentary. 1. Ọchịchị ga-adịzị n'aka ndị 'Constituents' Ọ bụzị ndị mmadụ ka ọ ga-adị n'aka ịhopụta onye ga-anọchị anya ha Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụkwa onye ọkaiwu a kpọrọ Ugochukwu Egbujo kọwara BBC Igbo n'ekwentị na mgbanwe a ga-eme ka ike si na gọọmenti etiti banye n'aka mpaghara nke a kpọọ 'constituents.' Ọ bụkwa ha ga-anọchịte anya ndị mmadụ n'ụlọomeiwu. 2. A ga-enwe agbanwe aha ụlọ abụọ e nwere na gọọmenti Ugbua a nwere ụlọomeiwu ukwu bụ Sinetị nakwa ụlọomeiwu nta bụ House of Representatives. N'okpuru ọchịchị 'Parliamentary', a ga-enwe ndị a na-akpọ House of Commons bụ ndị meriri ntụliaka nakwa House of Lords bụ ndị ahọpụtara iche abụghị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. 3. A ga-akwụsị ntụliaka maka ọkwa 'onyeisiala' kpam kpam Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019 Ọ bụrụ na a nabata usoro Parliamentary, ọ ga bụzi otu jiri ọkara maọbụ ihe karịrị ya merie ntụliaka ga-ahọpụta onye ga-abụ 'Praim Minista' nakwa Onyeisiala. Nke a pụtara na ọ bụghịzị ndị mmadụ n'onwe ha ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala. 4. Ego a na-emefu na ọchịchị ga-ebelata ọfụma Dịka e si eme na mba Briten nakwa ala ndị ọzọ hibere usoro Parliament, ọ ga-abụ n'etiti ndị nọ n'ụlọomeiwu ka a ga-esi họpụta ndị ga-ano n'ọkwa minista na ọkwa ndị ọzọ. Ihe nke a ga-eme bụ na ọ ga-ebelata ụgwọ a na-akwụ ndị a ga-ahọpụta maka ọkwa minista na ndị otu ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-48412650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48412650,Aisha Buhari: Ọrụ mwulite ndụ ndị mmadụ nke gọọmentị a kpụrụ afọ n'ala,Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari akatọọla ego dị ijeri narị naịra ise amapụtara maka nwulite ndụ ndị mmadụ ma kwuo na atụmatụ a mara afọ n'ala.,"Akụkọ dị mkpa Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara gọọmentị di ya Aisha, onye gosiri iwe ya mgbe ọ na-agwa ụmụnwaanyị okwu n'Abuja n'ụbọchị Tọzde kwuru na onweghi ihe ọbụla ahụrụ anya eji ego ahụ mepụta karịsịa ọkarịchara mpaghara ugwu nke a Nịajirịa. Aisha rụtụrụ aka na steeti ndị dịka Adamawa na Kano achịtaghị aja ọbụla n'ime atụmatụ a a kpọrọ 'Social Investment Programme' A sị na ọ bụ okwu na-ebute okwu. Okwu Aisha a mụnyere ọkụ na soshal midia dịka ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n'okwu a. Abiodun Bello sị ka Aisha kwụsị ịkatọ ọchịchị dị ya: Ebe Apha femal ji Aisha na tụnyere Patience Jonathan: Ipob kpachara anya unu - DSS Iwu ị nọ n'ụlọ nke otu Ipob nyere ndị otu ya abụrụla okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua karịsịa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na Naịjirịa. Cheta na ndị agha na ndị uweojii sị dị na mbụ dọọ Ipob aka na ntị mana ugbua ụlọọrụ DSS agwala Ipob na ha agaghị eji anya ọma ele onye ọbụla dara iwu. Ọ nụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunnaya, na ha ga-agba mbọ hụla na udo na nchekwa ga-dị na mpaghara Naịjirịa niile. N'ofesi Kọmishịọna mba Germany na-ahụ maka ịkpaoke ndị Juu bụ Felix Klein agwala ndị Juu ka ha kwụsị ikpu okpu ha ahụ n'ihu ọha n'ihi ịkpa oke megide ha na-arị ibe ya elu n'ọtụtụ ebe na mba. Klein kwuru na ọnụ ọgụgụ ikpaoke megide ndị Juu rịrị elu n'afọ gara aga dịka gọọmentị si chọpụta, na enwere mpụ ịkpọasị dị 1,646 e mere megide ndị Juu n'afọ 2018. Ebe mwakpo pụtara ihe e mere ndị Juu dị iri isii na abụọ n'afọ 2018. N'egwuregwu Messi ebee ọzọ Valencia agbawala Barcelona obi site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha ma buru Iko Copa del Rey nke afọ a. Agbanyeghi nke a, onyeisi Barcelona bụ Josep Maria Bartomeu ekwuola na Ernesto Valverde ga aga n'ihu n'ịchịkọta Barcelona. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Gburugburu: Ihe anyị ji echeta Gọv Ugwuanyi na nke anyị chọrọ n'aka ya ugbua" afirika-48944232,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48944232,Nigeria vs South Africa: Eagles arachaala Bafana ka banana,"Naịjirịa na Saụta Afrịka chipụrụ ya n'asọmpi nke agba nke anọ nke Afcon, ma gosi ha onye bụ eze.","Goolu William Troost-Ekong gbakpuru na nkeji 89 kụrụ ntu n'elu akpati ndị Saụt Afrịka bu bịa ije a. Naịjirịa gosiri na ha abụghị mmọnwụ a na-akwa aka site n'ọkara nke mbụ mgbe Samuel Chukwueze pịakpuru goolu nke mbụ na nkeji iri abụọ na asaa. Iji gosi na ya bụ egwu abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba, ndị Saụt Afrịka kpakwara ike nke ha oge Bongani Zungu nyere goolu biri n'azụ Odion Ighalo wee danyere ya. A jụrụ ihe onyonyo VAR ma ọ bụ ha gaa n'ihu kpọọ ya goolu tupu a gụnye ya ka goolu. Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ maka udịrị ike ọ kpara. Ka ọ dị ugbua, Naijiria ga-ezute onye ọbụla meriri n'etiti Ivory Coast na Algeria, n'agba nke ọkara-ikpeazụ. Lee ka o si kwuru" afirika-43773971,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43773971,Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibo k,"Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka Gọọmenti etiti agọnarịla akụkọ Ahmed Salkida wepụtara nke kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na ise n'ime ụmụakwụkwọ Chibok otu narị na iri na abụọ eji eji ka dị ndụ Onye ndụmaọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Malam Garba Shehu kwupụtara nke sị na aka Ahmed Salkida adịghị na mkparịta ụka ịtohapụ ụmụaka ndịa. Nwaanyị zutere ọnwụya n'akwamozu ọ gara n'Enugwu Steeti Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu kówara na ndị uweojii na-enyocha ihe mberede ahụ mere Ihe mgbawa obi emela mgbe onye bịara ịkwa ozu soro ozu laa mụọ. Otu nwanyị akpọrọ Ngozi Eze zutere ọnwụya dịka otu nwoke otu nwoke bụ Daniel Chukwu jiri egbe gbagbuo ya n'amaghị ama. Nke a mere na Amanato mburumbu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Donald Trump adọọla Gọọmentị mba Sirịa aka na ntị Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla ndị gọọmenti Sirịa aka na ntị na ha ndị na njikere ịtụ ogbunigwe ọzọ ma ọ bụrụ na o sepụghi aka n'iji ngwaagha kemịkal awakpo ndị mmadụ. Ebe gọọmenti mba Sirịa ekwuola na aka ha adịghị na ngwaagha Kemịkal na ọ bụ ndị agha nnupiisi boro ha ebubo ime mwakpo ahụ. N'egwuregwu Hawkins gara inweta ọlaedo ma ọbụrụ na ọ gbara ọsọ rue n'isi Ohere irite ọlaedo n'ịgba ọsọ ikeagwụnwamkpị n'egwuregwu Commonwealth akwala otu nwoke bụ Callum Hawkins nwafọ Scotland. Hawkins dara n'ala ugboro abụọ dịka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka o merie n'ọsọ ahụ nke mere onye ọzọ jiri rite ọlaedo ahụ. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa N'ihe nkiri a, Sịnetọ Enyinnaya nke Abia Steeti kwuru na ndị ọchị ehi chọrọ ị napụ ụmụ afọ Naịjirịa ala ha n'ike Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi." afirika-46885389,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46885389,IPOB: Atụmaatụ Egwu Eke chụpụrụ Nnamdi Kanu -Buratai,Ọ fọrọ obere ka Egwu Eke II loo onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.,"Onye kwuru nke a bụ onye ndu ndị agha Naịjirịa, Tukur Buratai. Buratai gwara ndị Naijirịa mgbe ọ na-emepe atụmaatụ a nke atọ na Lagos, na ya bụ Egwu Eke ha mere n'afọ 2016 nyere Nnamdi Kanu mbọbọ ọsọ. N'okwu ya, "" ya bịa ọgụ maọbụ na ọ chọọ."" Ọ bụrụ na ọ nwara anwa bịa ọgụ, Eke a ga-elo ya lomie ya. O jikwa ohere a gwa ndị omekome nọ na Lagos nakwa Ogun steeti ka ha gbara ọgwu ha nụọ makana Egwu Eke III ga-elo ha ma ha nwaa gosi ihu ha. Tukur kwuru na atụmaatụ a bụ iji kwado atụmaatụ ndị agha na-eme n'ụfọdụ akụkụ Naịjirịa maka idozi ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Burn survivor: Onye nwere apa gbalịa nabata ya - Kay Obum" afirika-43291844,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43291844,Onyeisiala mba Liberia George Weah baịra Naịjirịa taa,Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah gara Aso Rock taa ị hụụ onyeisiala Muhammadu Buhari.,"George Weah bụ onye egwuregwu AC Milan na Chelsea mgbe ọ na-agba bọọlụ Nke a bụ mbụ onyeisiala ahụ na-abịa ala Naịjirịa kamgbe o were oche dịka onyeisiala mba Liberia. Ndị isiala abụọ ahụ nwere ọgbakọ pụrụ iche nke ana anabataghị ndị mmadụ. Onyeisiala Weah bụbụ onye ọgba bọọlụ ṅụrụ iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Liberia ụbọchị 22 January afọ 2018. Ọchịchị ya bụ nke mbụ a na-enyefe ọchịchị n'aka onye ejiri ntuliaka onye kwuo uche ya webata kamgbe afọ 1944. Onye nyefere Weah ọchịchị bụ Ellen Johnson Sirleaf onye nọrọ n'ọchịchị afọ iri na abụọ. Sirleaf bụkwa onye napụtara m,ba Liberia n'agha ha na-alụ tupu o were ọchịchị. Ụlọọrụ onyeisiala ekwubeghi ihe Weah jiri bịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47815763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47815763,Nigeria election 2019: Ndigbo agbakpuru n'ochendo hapụ ka mmiri maa okeọkpa?,Obi na-atọ ọtụtụ Ndigbo ka nnu kemgbe akụkọ pụtara n'ụbọchị Wenezde na Inec kpọpụtara aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike dịka onye meriri ntulaiaka gọvanọ na steeti ahụ.,"Wike nke PDP onye nwetara 886,264 ma jiri vootu dị 712,405 merie Biokpomabo Awara nke AAC, onye nwetara 173,859 na mmeju ntuliaka e mere na steeti ahụ na nsonso a. Etu Ndigbo si kwadoo PDP na Rivas nakwa na ntuliaka onyeisiala na nke ọkwa gọvanọ kpalitere okwu ma Igbo a na-akọ n'ugbo onye ọzọ hapụ nke ha dịka pati e jiri mara ha bụ APGA na-asọ ngọngọ ka ọkụkọ udummiri. Mpụtara ntuliaka e mere gosiri na Igbo gbagara n'okpuru ochendo PDP n' eleghị anya n'azụ, ma hapụ mmiri ka ọ maa APGA n'anya. APGA gbara ọyụpa nke na APC bụ pati batara ọhụrụ n'ala Igbo kara ya nweta vootu. Iji maa atụ, na ntuliaka ọkwa onyeisiala n' Anambara, PDP nwetara vootu dị 524,738, APC nwetara 33,298, ebe APGA nwetara vootu dị 30,034. Lee tebulu mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala na gọvanọ: Mpụtara Ntuliaka Ọkwa Onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ Mpụtara Ntuliaka Ọkwa Gọvanọ n'Ọwụwa Anyanwụ Ndigbo ahụrụ PDP n'anya karia APGA? Na nkọwa ya, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Collins Okeke kọwara n'ihe mere Ndigbo jiri nye PDP nkwado pụrụ iche na ntulaiaka 2019 bụ maka na nwafọ ha bụ Peter Obi so Atiku Abubakar zọọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ahụ. Okere, onye bụkwa onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye kwuru na nke a apụtaghị na ha ajụla APGA. Rivers Election Result: Ndigbo ajụghị APGA- Onye ọnụ na-eru n'okwu N'otu aka ahụ, Chukwunonye Okereke kwụkwara na ọ bụ n'ihi na PDP bụ pati ọha dịka o kwuru na ọ na amasị Ndigbo isonye ebe ọkụ na-enwe n'elu, nakwa ebe a naghị akpa oke. ""Ọchịchọ PDP na Ndigbo dịka nnu na mmanụ."" ""Onye Igbo anaghị eme na nke a bụ nke anyị. Igbo bụ ihe bekee kpọrọ 'global citizen'. ""PDP bụ pati ndị mmadụ jịkọtara aka were bido. O nweghị onye nwe ya."" 'Ihe mere ọtụtụ Ndigbo ji akwado PDP karia APGA' Okereke, onye kwuru na ọ bụ Odumegwu Ojukwu ka Ndigbo soro banye APGA sị na ọ bụ 'mụ nwe pati' so na nsogbu na-amigbu APGA Akụkọ ga-amasị gị:" 42970951,https://www.bbc.com/igbo/42970951,Ụzọ asaa ị ga-esi echekwa onwe gị n'oge ọkọchị,Ndị ọkachamara NIMET ekwuola sị na ọkọchị nke afọ 2018 ga-aka njọ karịa afọ ndị ọzọ gara-aga.,"Ndị otu Nigeria Meteorological Agency (NIMET) bụ ndị na-ahụ maka ihuigwe na ikuku na ihe ndị ọzọ gbasara ya, kwuru nke a iji gosi na ihe ndị bekee na-akpọ 'ozone layer' na-agbanwe karịa etu o si eme n'afọ ndị ọzọ garaaga. Otu dọkịta a na-akpọ Ken gwara BBC ihe enwere ike ime iji kpuchie onwe gị niime ọkọchị, okwuru sị na nke a abụghị ọbere ihe maka na mmadụ niile na gburugburu ụwa kwesịrị ijikọ aka hụ na akwụsịrị ịmerụ ihuigwe ahụ. Ọ sịkwa na iji kwụsị ịmerụ ihuigwe ahụ, na ndị mmadụ ga-akwụsị igbutu osisi nakwa ịgba ọhịa ọkụ. Dọkịta Ken kwuru sị na ebe ịkwụsị nke a agaghị adị mfe, oke ọkọchị a bido, ndị mmadụ ga-achọ ụzọ ha ga-esi lekọta onwe ha ka ọ hapụ ịmerụ ha ahụ. Lekwa ihe ndị ọzọ okwuru sị mee iji lekọta onwe ha: O kwuru sị na ọ ga-adị mma ịṅụ mmiri oge niile, ka ị nwee ike nwete nri ndị na-enye ihe n'ahụ pụrụ site n'ọsụsọ sụrụ gị na mamịrị ịnyụpụrụ anyụpụ. 2. Ṅụọ mmiri si na mkpụrụosisi O kwuru sị na ịṅụ mmiri esi na mkpụrụosisi mepụta na-adị mma n'ahụ na-enyekwa ahụ gị ihe ndị ọchọrọ. 3. Mepee mpio gị O kwuru sị gbaa mbọ hụ na ị mepere mpio gị ma n'ụtụtụ ma n'abalị ka ikuku nwee ike ịbata ma n'ụlọ ma ebe ị na-arụ ọrụ. 4. Yiri uwe dị fịrịfịrị n'ahụ O kwuru sị na ọ na-aka mma iyi uwe dị mfe n'ahụ maka na iyi ihe dịka uweojii na-eme ka ọsụsọ dọrọ n'ahụ, nke ga-eme ka ahụ kpoo gị ọkụ. 5. Kpuru okpu sarambara O kwuru sị na ọ na-adị mma ikpu okpu sarambara nke nwere ike ikpuchi isi gị na ihu gị ka anwụ ghara ịtụ gị n'ahụ. 6. Tee ude na-egbochi anwụ (sunscreen) O kwuru sị na ọ na-adị mma ite ude a ka anwụ ghara ịgba gị ọkụ n'ahụ. 7. Saa ahụ O kwuru sị gbaa mbọ saa ahụ gị maọbụ hụ na ịwụsara mmiri n'ahụ gị oge ọbụla inwetara ohere. Okwuru sị na imee ihe ndị a, inwere ike igbochi ihe ndapụta na-eso ọkọchị dịka: ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa, ịgbọ agbọọ, isi ofufe, oke ọsụsọ nakwa nke kacha njọ bụ kansa nke anụahụ." afirika-48569933,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48569933,Cabinet Reshuffle: Ụmụada Ebonyi steeti arịọla ka gọmenti etiti cheta ha n'ọchịchị,Otu jikọtara ụmụnwaanyị n'Ebonyi steeti akpọrọ Ebonyi Women Vanguard (EWV) arịọla onyeisiala Muhamadu Buhari ka o biko cheta ha mgbe ọ ga-ekewa ọchịchị n'agba ọchịchị nke ugbua.,"Onyeisi ụmụnwaanyị a bụ Immaculata Ibe rịọrọ arịrọ a taa n'Abakaliki tupu gọmenti steeti ahụ enyefewe akwụkwọ ndị ha chọrọ ka gọmenti etiti nye ọkwa minista. Otu a nọchiri anya ụmụnwaanyị bi na ụzọ na ndị bi n'ama sị na oteela eleghawara ụmụada steeti ahụ anya n'ọkwa ọchịchị gọmenti etiti. Immaculate sị 'anyị na-arịọ ka onyeisiala Buharị tinye, ọbụnadị otu nwaanyị, n'ọkwa gọmenti etiti mgbe ọ ga-eru"". Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu O kwuru na ọnwebeghị mgbe nwaada Ebonyi sugoro dị ka Minista na Naịjirịa kemgbe ekere ya bụ steeti n'afọ 1996 agbanyeghị na ogbo ha ndị ala Igbo ndị ọzọ anọchaala na ya bụ ọkwa di elu. Immaculata sị na a na-akpachapụ ha n'ụsọ agbanyeghị ezigbo ọrụ niile ha na-arụ na Naịjirịa. Ọ na-arịọ ka a kpụọ ha isi akpụrụ albati. Lee ihe nkiri anyị International Women's Day: 'Agaghị m ata onwe m ụta na m bụ nne na-arụ orụ- Ngozi Nwobia Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48562510,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48562510,Fake News: Ezigbo ọrụ ntaaakụkọ bụ iwepụta akụkọ dịka o si mee- Ndị ọnụ eru n'okwu,"Ndị ọnụ na-eru n'okwu gbasara ntaakụkọ na mgbasaozi tinyere ọnụ na mkparịụka BBC banyere ọrụ ha nke isiokwu ya bụ ""Akụkọ Ụgha, BBC Igbo na Ndigbo"" ekwuola mkpa ọ dị ikwu eziokwu n'agbanyeghị onye ọ metụtara.","Chiagozie Nwonwu, Clara Chinwe Okoro na Immanuel James Ibe-Anyanwu Ndị tinyere uche n'okwu a bụ: Blossom Ozurumba, bụ onye na-ede akwụkwọ ma na-edekwara ndị 'Wikipedia' edemede; Clara Chinwe bụ onye ntaakụkọ nakwa onye nwe Brand World Media na Immanuel James Ibe-Anyanwu bụkwa onye na-ede akwụkwọ. Clara Chinwe Okoro Lee okwu ndị kgbara ọkpụụkpụ ha tụpụtara: Gini mere BBC Igbo ji ebu akụkọ ọjọọ maka ihe gbasatara Ndigbo? Clara Nwankwo: Anyị bụ ndị mgbasa ozi, anyi na akọ akụkọ otu o si mee. Ihe ọjọo na-eme, ihe ọma na-emekwa. Ọru anyi bụ ịkọ ya dika o si we di. Onye ntaakụkọ BBC: Iji maa atụ: Ihe BBC gosiri maka Mee 30th bụ ihe anyi hụrụ. Anyi gara na isiobodo steeti dị n'ala Igbo na ahia na ebe ndị ọzọ ndị mmadu na-agbakọ were kọpụta ihe anyị hụrụ. Anyi mekwara ihe onyonyo('Live Video) anyi kpọrọ ""Ka o si aga"" nke anyi jiri gosi ndi uwa ka ala Igbo si eme mmemme ncheta Biafra. Kedu etu a ga esi mee ka igu akụkọ di mfe na soshal Midia? Onye ntaakụkọ BBC : Maka na ọ bughi BBC nwe Soshal Midia ndị a, ọ na aka mma onye chọro i gu akụkọ anyi na uju ya, onye ahu ga aga na websịtị anyi were gụọ ya. ọnye ahu ga aga na www.bbcigbo.com ma ọ bụ www.bbc.com/igbo Kedu ihe BBC na eme maka ikwalite asụsụ Igbo ? Onye ntaakụkọ BBC: BBC na egosi ihe onyonyo di iche iche i ji kpalite omenala ndi Igbo. ọnye gara na websịtị anyi ga ahụta ihe ndịa. Gini kpatara ụfodụ mmadu ji achọ okwu ma na ekwu okwu di njọ na sochal midịa? Blossom Ozurumba: Ụfọdụi ndị bu na ha enweghi ezigbo ọzuzụ, ya mere ha na eji a bia na soshal midia ekwu okwu na adighị nma. Ndi madu nwere ike ikpesara ndi na achikota Facebook na Soshal Midia ndi ozo ka ha lebe ndi na eme ajọ omume a anya ma wepu ha na soshal midia. Blossom Ozurumba Kedụ ihe mere enweghi BBC n' Ọwụwa-Anyanwu ? BBC: Nwayọ nwayọ ka e ji eracha ofe di ọkụ. Ebeọbula BBC nọ ugbua, ihe kacha mkpa bu na anyi na ewetere ụnụ ihe n'eme na ala Igbo .Anyi nwekwara ndị nta akụkọ na steeti nile di na ọdida anyanwu. Ajụjụ: Kedu ka BBC si agbasa ozi Ọzịza: BBC agaghị egosi ihe ga emeru obi ndị mmadu, ihe dịka ọbara ma ọ bu ebe egburu madu. BBC ga akọ akụkọ otu o ga esi masi mmadu nile. : Gini mere ndi nta akuko BBC anaghi etinye mmetụta uche ha. Immanuel James Ibe-Anyanwu: Gini mere ndi nta akuko BBC anaghi etinye mmetụta uche ha? Onye ntaakụkọ BBC : ""Nwa madu emegbuna nwa muo , nwa muo emegbuna nwa madu"". Anyi na akwụba aka anyị ọtọ na akọ akụkọ di ka ọ si dị. Onye mee mma BBCIGBO ga akọ ya, ọnye mee njo BBCIGBO ga ako ya di ka o si di. Immanuel James Ibe-Anyanwu Leezie ihe ha kwuru n'uju ya n'ihe nkiri dị n'elu: Akụkọ ga amasi gị :" afirika-44479225,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44479225,Ọchụehi Abia: Anyị agaghị ewepụ iwu nchịgharị ehi - ndị omeiwu,Onyeisiụlọ omeiwu nke Abia Steeti bụ Chikwendu Kanu akatọọla ndị na-akpọ oku ka-ewepụ iwe machiri ịchagharị ehi na Steeti ahụ.,"Nsogbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo atala isi ọtụtụ ndị mmadụ. O kwuru na ndị na-akpọ oku a amaghị ihe nakwa ikikere ndị ụlọ omeiwu steeti nwere ime mkpebi ha. Cheta na Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Mansu Dan-Ali gwara onyeisiala Buhari ka okpochapụ iwu megidere ịchagharị ehi n'ụfọdụ steeti. Ma kwuo na ọ bụ naanị ụzọ a ga-eji weta udo n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo. Mana ụlọ omeiwu nke Abịa Steeti mere iwu ga-akwụsị ịchagharị ihe na Steeti ahụ ma kwuo na onye e jidere ga-akwụ puku narị naịra abụọ ma ọ bụ gaa mkpọrọ afọ isii. N'okwu ya Kanu katọrọ ndị na-akpọ oku ahụ, kwuo na ụlọ omeiwu ọbụla na-eme iwu ga-echekwa ndị ọ na-achị. Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Chikwendu kwuru na iwu a dị n'ike ndị ụlọ omeiwu ime nke mere ha jiri hiwe ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48646225,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48646225,Mikel Obi: Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON,Mikel Obi ga-edu ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gaa mba Ijipt maka asọmpi Iko mba Afịrịka akpọrọ AFCON 2019 ekwuola na ọ bịaghi igwu egwu n'ihi na imeri ma buru kwa iko AFCON na-agusi ya ike.,"Ọnyeisi Ndị otu Bọọlụ Naịjirịa - Mikel Obi O ruola afọ isii Mikel Obi metụrụ Iko Mba Afịrịka aka. Mgbe ahu bụ mgbe Naịjirịa meriri na mba Saụt Afịrịka. Mgbe ọzọ Mikel gbata ihe n'Afịrịka bụ n'afọ 2006 na 2010 bụ mgbe otu Super Eagles gbatara ndị nke atọ. N'oge AFCON a, Mikel ga-edu ndị ụmụ okorobia ọbara ha dị ọkụ were sọọ asụmụpị nke afọ a na Ijipt. Mikel kwuru: ""N'agbanyeghi na ndị otu Eagles nke ugbua abụghị ndị aka ochie n'izute mba Afịrịka ndị ọzọ ka ya, asụmpị a ga-enye ndị dị ka Samuel (chukwueze) na Paul (Onuachu) ohere igosiputa nka ha. Enwekwara m olileanya na anyị ga aga ijiptu ma tụrụ ugo lọta."" Ndị otu Super Eagles O kwukwara n'obi dị ya ụtọ etu ndị Super Eagles siri agba mbọ n'agbanyeghi ọnyụpa ha dara n'asụmpị Iko Mba Uwa. Mikel kwetere na asụmpị a ga-esi ike mana o kwenyere na nka na nkwado ụmụ Super Eagles ga enyere ha aka imeri asụmpi a. Chetakwa na Mikel Obi gbaara Naịjịria bọọlụ nke mbụ n'afọ 2005 mgbe Super Eagles na otu egwuregwu mba Libya zutere. Mikel kwuru n'asọmpị a nwere ike ị bụ nke ikpeazu ya n'uwe Super Eagles. Ọ sị; ""otu ọbula ọ dị aga m agbalị ka ọ di nma.""" afirika-45466278,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45466278,Ndị nwoke na-akpagbu anyị na ndọrọndọrọ - Ụmụnwaanyị,Ụmụnwaanyị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Kogi steeti ekwuola na ndị gbo ha ụmụnwoke na-anapụ ha ohere ịzọ ọkwa ọchịchị nakwa akpachikọrọ ọkwa niile.,"N'okwu ha gwara ndị ntaakụkọ na Lokoja, ha kwuru na ndị nwoke na-eji ụmụnwaanyị eme ndị mbinye aka na-enyeghi ha ohere ịzọ ọkwa ọchịchị. Nwada Kemi Oluyori bụ onye zọburu ọkwa ụlọomeiwu ndị Kogi steeti kwuru na enyeghi ya ohere dịka nwaanyị isonye na ntuliaka ime ụlọ nke pati ya mere. ""Mgbe m kwupụtara uche m ịzọ ọkwa n'afọ 2014, ndị ụmụokoroọbịa bịara n'ụlọ m n'ime abalị ahụ ị dọ m aka na ntị maka nke a. Ha ṅụrụ iyi imechu m ihe maka m chọrọ ịzọ ọkwa."" Oluyori kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha gbaa mbọ tụnyere nwaanyị ibe ha n'otu ọkwa ọchịchị iji wee kwuchite ọnụ. Otu nwaanyị akpọrọ Bisi Abejide kwuru n'ọtụtụ oge a na-akwagide ụmụnwaanyị n'ike ịtụnyere onye ọbụla di ha na-akwado n'ọchịchị. Eunice Atuejide Feminist. N'aka nke ọzọ, otu nwaanyị chọrọ izọ ọkwa ụlọomeiwu nta bụ Aderemi Adebowale kwuru na ụmụnwaanyị ka ndị nwoke mma n'ọchịchị. O kwuru na ụmụnwaanyị ga-enye ndị Naịjirịa ntuziaka ọhụrụ tara ọchịchị. N'ọkwụ ya ""Ihe ọbụla nwoke na-eme, nwaanyị ga-eme ya karịa."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52553379,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52553379,"Igbo Tradition: Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo",Nwaagbọghọ Igbo ọbụla na-amaghị ka e si etecha onwe ya dị ka nkịkara akwa n'anya ụmụagbọghọ ibe ya.,"Etu ụmụnwaanyị Igbo si achọ mma oge gboo dị iche na nke oge ugbua Ị chọrọ ịma agbọghọ chapụrụ achapụ, ị lee ya anya ị ga-ahụrịrị ka ahụ ya si akwọ mụrụ mụrụ maka ihe ntecha dị iche iche o jiri chọọ onwe ya mma. Akụkọ a ga-egosi anyị ihe ntecha ole na ole ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe elu ka bụ ala ọsa. 1.Ka anyị malite n'ọtangele: Ọtụtụ ihe ndị e ji achọ mma n'oge gboo bụ na mgbọrọgwụ osisi dị icheiche ka e si enweta ya Ọtangele bụ pawụda ojii. Ọ dị ka ihe eji unyi akwọrọ akwọ wee mee. Nke a bụ nke a na-akpanye n'anya. Ụfọdụ na-akpọ ya tiro. Ụmụagbọghọ techaa ọtangele, anya ha a na-egbuke ka ọnwa. Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke 2.Uri Ihe ntecha a esi na mgbọrọgwụ enweta bara ezigbo uru n'ala Igbo makana eji ya ese eserese n'ọnụ maọbụ ụkwụ nwaanyị Igbo ọbụla ọ na-amasi. O nwereike ite ya n'ahụ ma ọ na-eme emume alụmdi na nwunye maọbụ ọ gawa mmemme ndị ọzọ a na-eme n'ala Igbo. E nwekwara ike iji uri dozie ụlọ maọbụ ahụ aja ụlọ mmadụ. Mbata ozioma nke Jesu Kristi metụtara etu esi akwanyere uri ugwu maka na ndị ụka na-eche na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ. Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo 3.Uhie Uhie bụ pawụda na-acha uhie uhie. A na-eji ya akwado ụfọdụ ụmụagbọghọ maka alụmdi na nwunye n'oge gboo. E techaa nwaagbọghọ uhie a, ahụ ya a na-akwọ mụrụ mụrụ. 4. Ayọrọ Mgbaji Nke a bụ nke a na-eke n'ukwu nakwa n'olu Nke a bụ nke ụmụagbọghọ na-anya n'ukwu ma n'olu. Ọ na-abụ nwaagbọghọ chọọ ịlụ di, a nyanye ya n'ukwu, olu ma ụkwụ ka ndị mmadụ kiriwe mma ya. Ọ na-achakarị uhie uhie maọbụ ọcha. Gịnị na-emezi ugbua? Ihe ntecha ụmụnwaanyị n'oge ugbua yitekwara nke ndị gboo mana ihe dị iche dị n'etiti nnukwu 'B' na ọkpa ehi Ihe ejirila ike gbanwe ugbua dịka ihe ndị a gbara kasa. Ọtangele, Uhie ọnụ ma ayọrọ mgbaji eyirila uwe ọhụrụ nke buzi na onye ukwu ma onye nta jizi ha eme ngala ma na-enweta ezigbo ego site n'ire ha. Ndị ntecha mere aka ọrụ na-ekwusi ike na ọ na-agara ha ezigbo ahịa makana nnunu ichọ mma ahụ na-ebe mgbe ahụ n'etiti ụmụnwaanyị ka na-ebe ugbua. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-56366139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56366139,Bishop Kukah: Gịnị na-esere Nnamdi Kanu na Fr Abiagom?,Otu ụkọchukwu Katolik bụ Fada Augustine Abiagom adọtaala okwu na soshal midia dịka ọ gwara onye ndu otu nnweereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu uche ya maka ikwugide Bishọp ụka Katọlik bụ Bishop Mathew Kukah.,"Fada Abiagom katọrọ Nnamdi Kanu maka imaja Bishop Katolik si na ya ga-abụ ya ọnụ n'ọha ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ikwu ọ kpọrọ ""okwu ga-ewe Chineke Iwe"". Aga m abụ Kukah ọnụ ma ọ bụrụ na... - Nnamdị Kanu N'ozi ahụ nke ọ gbasara n'intanet na mbido izu a, Kanu gwara ndị ụka Katolik n' ụwa niile sị, ""Dọọnụ Bishop Kukah aka na ntị, ka ọ kwụsị okwu na-ewe Chineke Kachasị, iwe. E meghị etu a, aga m abụ ya ọnụ n'ọha."" Bishọpụ Mathew Kukah Aka Kanu rụrụ Kukah n'ihu na-abịa dịka Kukah bụ Bishop Sokoto Dayọsisi kwuru ụbọchịụka na "" O nweghị ihe onye ọbụla ga-erite ma ọ bụrụ na Naijiria ekewaa."" O nweghị uru dịrị onye ọbụla ma Naijiria Kewaa- Kukah Kukah gakwara n'ihu ozi ahụ nke ụlọakụkọ Vanguard wepụtara sị, ""Echeghị m na onye Naijiria ọbụla iji uche ya ga-ameme ka na ọ nweghị ihe jikọrọ anyị ọnụ."" Okwu ndị a bụ ihe ụfọdụ na-ekwu kpasuru Nnamdi Kanu bụ onye na-agba mbọ ka e kewapụta Biafra na Naijiria, iwe. Fada Abiagom kwuru na ụdị okwu mkpali ahụ megide nnukwu ụkọchukwu Katolik jọgburu udele, sigbuo nkapị n'isi. Abiagom, kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'ihe Bishop kwuru banyere ịdịnotu na-agbanyeghị ebe onye si. 'Ndi uweojii ejighị Nnamdi Kanu na Singapore' ""Ọ bụrụ na i kwenyeghị ihe Bishop kwuru maka ịdịnotu, nke ahụ bụ echiche ya, i nwere ike ịgbagha ya na-ejighị iwe na mkpalị megide ọkwa Bishọpụ na-anọchite."" Fada Abiagom, onye jiri Moses n'Akwukwọ Nsọ were maa atụ, kwuru na Moses chikọtara ndị okenye Izrel ya na ha nyụkọ mamiri ọnụ iji nweta nnwereonwe ụmụ Izrel, were gaaa n'ihu kwuo na ipob agaghị achịta aja ma ọ bụrụ na ha ndị nọ n'ọchịchị ejikọtaghị aka chọwa ihe dara mmiri. Ọ dụrụ Kanu ọdụ ka ọ ghara ịhapụ ""ọrụ nnwereonwe Chukwu kpọrọ ya mee onwe ya Chukwu."" N'okwu ya, Abiagọm jụrụ sị,""Onye pụrụ ịbụ ụkọchukwu nke Chineke,nnukwu Bishọpụ e doro nso nakwa onye apọstụ ụka ọnụ? A gafela oke na ọrụ Chineke nyere gị."" Ihe Ipob sara Fada Abiagom N' ịzaghachi ya, otu Ipob kwuru na ha na Fada Abiagom enweghị okwu ọbụla n'ihi na ọ bụghị ọnụ na-ekwuru Kukah. N'ọsịsa nke ọkaiwu otu Ipob bụ Aloy Ejimakor nyere BBC n'ekwenti, Ipob kwuru na o nweghị esemokwu dị n'etiti Kukah na Ipob maọbụ onye ndu ha bụ Kanu mana ọ bụrụ na Kukah kwuo ihe ha anabataghị, na ha nwere ikike ịgbagha ya okwu. Ihe mere Facebook ji machie Nnamdi kanu ""O nweghị onye ga-akụkọ Fada Kukah na Nnamdi Kanu isi."" ""O kwuo ihe metụtara Ipob maọbụ ihe Ipob achọghị, Ipob na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nwere ikike ikwu uche ha iji saa ya."" ""O nwere ndị na-achọ ịkụkọ ha abụọ isi, ọ gaghị adị ile."" ""Fada ahụ abụghị ọnụ na-ekwuru Fada Kukah, anyị enweghị ihe anyị ga-asa ya."" N'aka nke ọzọ, ebe ụfọdụ na-eto Fada Abiagom, ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ ya, na-ajụ ya ebe ọ nọ kemgbe ihe na-emebi ghara itinye ọnụ ịkatọ ihe ndị na-emebi ihe n'ala Naijiria." afirika-48447720,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48447720,"Chelsea vs Arsenal: Etu ọ sọrọ ụwa ya mee, Arsenal gba aka iko n'afọ a",Egbe ndị Arsenal ji bịara Chelsea ọgụ nyụrụ nkọ ma wụrụ osisi taa ka Chelsea ji ọkpụ anọ a satara naanị otu merie ma buru iko.,"Chelsea lụrụ Arsenal ka nwaanyị N'agbanyeghi na enweghi onye ji goolu gbawa ibe ya obi n'ọkara nke mbụ, Chelsea bịara teta na nke abụọ. Goolu Olivier Giroud nyere na nkeji 49 na nke Pedro ji gbarie Petr Cech obi na nkeji 60, nyere ndị na-akwado ha olileanya ibulata iko a. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Eden Hazard ejiri penariti dọrikwa neetị Cech. Unai Emery bụ onye nchịkọta Arsenal bịara webata nwaafọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi na nkeji 66. Na-erughi nkeji atọ e tinyere ya, na nkeji 69, Iwobi agbaa aka ahịa ozugbo, nyetu ndị Arsenal obere olileanya. Mana Chelsea napụrụ ha mmiri n'ọnụ ha Hazard tụkwasịrị ya nke anọ na nkeji 72, iji kpọọ ntu n'akpati bu ndị Arsenal. Nke a mere ya ugboro abụọ Chelsea na-amabute iko Europa League a Otu egwuregwu abụọ si mba Briten bụ Chelsea na Arsenal zutere n'isi obodo mba Azerbaijan bụ Baku, isukọta mpi ha ji mara onye bụ oke na mgbacha Iko Europa nke 2019. Ha agbaghị ndị na-akwado ha ọtọ dịka ha si mpaghara ụwa dị iche iche wụchie Baku maka asọmpi a bụ nke ugboro 198 otu abụọ a na-ezute. N'afọ 2015, Cech si Chelsea gafee Arsenal, mana ihe dị ịtụ n'anya bụ na asọmpi a ga-abụ nke ikpeazu ọ ga-agba n'ụdịa makana ọ na-ala ezumike nka. Arsenal ebee Ndị Chelsea kara ahụ napụ Arsenal olileanya ha nwere iji awụbanye asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020. Emery bụ onye asọmpi Europa doro anya (Emery ebutela Iko Europa ugboro atọ), akpaghị ike makana nke afọ kwara ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46525967,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46525967,Judaism: Ndị Ipob na ndi okpukpere Juu mere ngagharịiwe n'Abia,Ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela ndị okpukpere Juu mmadụ n'Umuahia maka ikposa obodo.,"Ọgbaghara dara n'ehihie ụbọchị Tuzde ka igwe ndị okpukpere Juu jupụtara n'okporoụzọ na-eme ngagharịiwe na-ekwu ka e nye ha Biafra.. Ndị nọ n'ebe ihe mere kwuru na ndị uweojii jiri anwụrụ anyammiri (teargas) chụsasịa ndị ahụ ji uwe nwụda ọcha, ma nwụchịkwa ụfọdụ n'ime ha. Mana ha gbasara ma lọghachikwa ọzọ, ebe ndị uweojii sochikwara n'ike. ma gaa n'ihu ịgba ha anwụrụu anyamiri. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ngaghariiwe ahụ mere n'ezie. Mana o kwuru na ọ bụ ndị Ipob kwunyere ndị okpukpere Juu were mee ngagharịiwe. Ọ gara n'ihu kwuo na ha anwụchiela ụfọdụ n'ime ndị mere nke a, ebe ha nwetara ihe njirimara otu Ipob gụnyere ọkọlọto Biafra. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50231871,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50231871,Anambra doctors give ultimatum: 'O nweghi uru dị n'ịgba abụbụọrụ ndị dọkịta n'Anambra',Gọọmentị Anambra Steeti ekwuola na o nweghi uru dị n'isi azụ banyere abụbụọrụ ndị dọkịta steeti ahụ sị ha ga-agba.,Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Ndị dọkịta ụlọọgwụ Odumegwu Ojukwu dị n'Amaku Awka sị na ha ga-eme nke a n'ime izuụka na-abịa maaọbụrụ na gọọmentị azaghị oku ha kpọrọ ka e bulie ụgwọọnwa ha. Mana Kọmishịọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba sị na gọọmentị dị na mbụ na-eleba anya n'ihe banyere ụgwọ ọnwa a. Adinuba sị na gọọmentị hiwere kọmitee nọ ugbua na-eleba okwu a anya kamgbe ọnwa Julaị ndị dọkịta kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara. Adinuba sị ka ndị dọkịta a nwee ndidi na gọọmentị ga-emezu nkwa ha n'oge na-adịghị anya. Cheta na ha gbaburu abụbụọrụ nke mbụ ruo mgbe gọvanọ Willie Obiano kwere ha nkwa itinye anya n'inuli ụgwọ ọnwa ha. Ikpe bụ nke Chineke - Secondus Onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus ekwuola na ikpe niile dị n'aka Chineke Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kpebiri na ọ bụ onyeisiala buhari meriri Atiku Abubakar nke PDP ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a. N'ofesi Onyeisiala mba Chile bụ Sebestian Pinera esepụla aka ile otu United Nation ọbịa n'ọgbakọ ọnọdụ ihueluigwen'ihi ngagharịiwe a na-eme na mba ya. Ọ sị na ọ bụ nwute ka o ji kagbuo ọgbakọ a kwesiri ịdị n'ọnwa Disemba kama na ime udo n'obodo ya ka dị mkpa. N'egwuregwu O ga-adịkwa kpọkpọ na mba Ịngland n'abalị a mgbe Chelsea ga-ele Manchester United ọbịa ebe Liverpool ga-anabata Arsenal n'asọmpi Iko Carabao. Manchester gbara Chelsea ọkpụ anọ chara na nzute ha n'afọ a ebe Liverpool gbara Arsenal ọkpụ atọ asatara otu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke Umu Naịjirịa arachaala Ecuador ka ofe ọha Ibrahim Sai'd (onye gbasara aka) nyere goolu atọ Ibrahim Sa'id zara Omekaagụ n'abalị Tuuzde mgbe o nyere goolu atọ nke Naịjirịa ji merie mba Ecuador na asọmpi iko mba ụwa maka ụmọnwoke na-akarịghị afọ iri na asaa. Mmeri a mere ka Naịjirịa tozuo ịgafe n'agba nke abụọ asọmpi a nke na-aga n'ihu na mba Brazil. Cheta na ụmụ Naịjrịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Họngarị n'asọmpi nke mbu ha gbara. Naịjirịa bụ ndị nke mbụ n'otu 'B' ebe ha ga-ezute mba Ọstralia n'ụbọchị Fraịde. Otu okwe si gbaa Aha otu egwu bọọlụ Naịjirịa maka ụmụnwoke akarịghị afọ iri na asaa bụ 'Golden Eaglets.' Ha eturula ugo na asọmpi a ugboro ise n'oge gara aga. Gịnị na-akpata ọnwụ ụmụaka? Nwa a mụrụ ọhụrụ. Amalitela nnyocha pụrụ iche n'Enugwu steeti iji chọpụta ihe na-akpata oke ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa. Nnyocha a ga-enye aka iji mata etu a ga-esi gbaa ya bụ ụzọ owere mgba ka o wee chie. Ntuliaka na Briten Ndị omeiwu Briten Ndị omeiwu mba Briten ekwetala na a ga-enwe ntuliaka n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba afọ a ka ndị mmadụ were aka ha họrọ ndị ha chọrọ ka ha nọrọ n'ọchịchị. Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kwuru na ntuliaka a ga-enye ya nkwado ọ ga-eji gaa n'ihu ịchọ ụzọ UK ga-eji si na European Union pụọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: afirika-44639847,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44639847,Ndị nkuzi ga-amalite abụbọ ọrụ taa na Krọs Riva,A na-anụ kepu kepu na ndị nkuzi nọ na Cross-River steeti ahọpụtala taa dịka ụbọchị ha ga-ebido abụbọ ọrụ.,"Ndị na-akwado ị me nke a bụ ndị nkụzị ụlọakwụkwọ pramarị nakwa sekondrị na gburugburu steeti ahụ. Ha kwuru na iwe ha bụ na gọọmentị ha etinyeghị uche n'ihe gbasara ọdịnma ndị nkuzi na steeti ahụ. ""Anyị kwekọrịtara nke a mgbe anyị mechara nzụkọ gbasara omume gọọmentị steeti anyi n'ihe gbasara ọdịnma ndị nkuzi"" bụ ihe onyeisi oche otu ndị nkuzi depụtara n'akwụkwọ ozi. Abụbọ ọrụ ha ga-abụ nke usoro nke akpọrọ 'indefinite strike' na asụsụ bekee N'akwụkwọ ozi ha nke onye odeakwụkwọ otu ndị nkuzi bụ R. Anyadike binyere aka ha depụtara ụfọdụ ihe gọọmentị steeti ha na-eme adịghị ha mma n'obi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46237004,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46237004,Food poisoning: Etu ị ga-eji gbanarị nsị nri,"""Nsị ọnụ abụchaghị ihe mmadụ na erite maka na mmadu tunyere ya ọgwụ na nrị,"" Dọkinta Eghosa Emasuen gwara BBC.","Na nkọwa ya, ọkachasi ebe ndi mmadu si adata nsị ọnụ bụ site na nrị ha riri, ebe nsị dị n'ime ya bụ ihe nje butere na nri ahụ. Emasuen kọwara na nje dị icheiche na-efesa nrị, mana ọ si na ọ bụ nke akpọrọ e coli bụ nke kachasị emepụta nsị nrị. ""Ọ bụ nje bacterium Clostridium botulinum na emepụta botulinum toxin - ihe na-ebute nsị nri."" O kwukwara na ihe a so nsị kachasị sie ike n'ụwa a. Nsi nri na-enye ezigbote nsogbu ma ya fesa mmadụ Na nkọwa Dọkinta Emasuen; ọ bụ mmekọrịta nje na nri na emepụta nsi a na-enye mmadụ nsogbu. Ọ sị na nje a nyụpụtacha nsị a, mmadụ rie nri ọ di na ya, onwereike nye mmadụ obele maọbụ nnukwute ọrịa, ma nke nwereike gbuo mmadụ. Unu anụala ya, nsị dị a nri bụ ihe nje na-ebute. Ọtụtu oge ọ bughị ndị kpọrọ gi asị na-etinye ya. Ọtụtụ nri a na-ere n'ụzọ adịghị abụ ndị asacara aka ọfụma mee Lee nu etu esi egbochi ya: 1) Saacha aka gị ọfụma Dọkinta Emasuen kwuru na nje na-abakarị nri site na adịghị ọcha. Yabụ, onye na edowe onwe ya ọcha site n'ịsacha aka ọfụma ma emetụcha ihe dị ụnyị aka. Yabụ, ịgacha mposi, saa aka gị tupu ịmetụ nri aka. 2) Saacha nri gị Ọtụtụ nri, ọkachasị ndi nwere okuko, na-enwe nche nke na-egbochi nje ịba ha n'ime ha. Mana, ọ na-aka mma ịsacha ha ọfụma tupu itinye ha n'ọnụ. Nke a pụtara na ịsacha nri bụ ihe dị ezigbote mkpa ma ichọọ igbochi nsị nri. 3) Nyocha ihe ọbula ịchọro iri tupu irie ya. Emasuen si na ọtụtụ mmadụ na-ebute nsị nri maka etu esi hazie nri ahụ, ọkachasị mgbe nri ahụ ka dị oyi oyi. Okwuru na nri nsị dị nwereike na-esi ajọ usi, maọbụ koo eko ma ọ bụrụ na ọ di n'iko. Ya bụ, jiri anya na imi gị nyere onwe gị aka. 4) Sie nri ọfụma Nke bụ ihe Dọkinta Emasuen si bụ egwu eji maka igbochi nje and nsị nri ha na-ebute. ""Ọkụ na-egbu ma mebie ọnọdụ nje na nsi ha, nke mere na isi nri bụ ihe kachasị egbochi ya,"" Emasuen kwuru." afirika-46028674,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46028674,Trump: Aga m akwụsị ndị mba ọzọ amụrụ n'Amerịka ị bụ ndị mba anyị,Akụkọ dị mkpa Nwa mba ọzọ a mụrụ na Amerịka agaghị abụzị nwafọ Amerịka - Trump,"Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-akwụsị ikike iwu kwuru na nwa ndị mba ọzọ a mụrụ na Amerịka ga-abụ nwafọ mba Amerịka. Ọ gbarụrụ ihu na ọ bụ naanị Amerịka ka ụdị iwu a dị ire, ma kwuo na ọ ga-agbanwe iwu a ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị tinyere aka n'akwụkwọ. Trump kwuru na nke dị mkpa maka ibelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-abata n'Amerịka kwa mgbe. Buhari aṅụọla iyi maka ọgbaghara Kaduna Onyeisiala Muhammadu Buhari aṅụọla iyi na ọ ga-ememina ndị aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ na Kaduna Steeti. N'aka nke ọzọ ndị uweojii na ndị otu Shiite na-achịpụ ya na mpaghara Wuse dị n'Abuja dịka ọtụtụ ụgbọala gbarala ọkụ. Nye anyị nghazigharị obodo were onyeisiala - OYC Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo nke onyeisi ha bụ Kingsley Dozie tinyere ọnụ na ka enye ha nhazigharị obodo karịa onyeisiala n'afọ 2023. Ha gbarụrụ ihu n'okwu minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Babatunde Fashola kwuru na ọ bụ ndị ndịda anyanwụ nwe ọkwa onyeisiala n'afọ ahụ. N'ofesi Otu onye nọọsụ na mba Jamini akpọrọ Niels Hogel ekwupụtala na o ji ọgwụ gbagbu otu narị mmadụ dịka a na-ekpe ya ikpe. O kwuru na ọ bụ ka owere ya gosi ndị nọọsụ ibe ya na ọ ga-etuteli ndị ọ gbara ọgwụ ahụ. N'egwuregwu Onye na-agbara Tottenham bọolụ bụ Dele Alli etinyela aka n'akwụkwọ ga-agbatị ọnụnọ ya na Tottenham rue afọ 2024. Nwa amadịa batara n'afọ 2015 enyeela gọọlụ iri anọ na asatọ n'asọmpi otu narị na iri ise na atọ. Nkeji abalịa: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: 'Ndị ibe anyị na-azọkwasa anyị ụkwụ n'isi' - Uko Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ Gọvanọ ndị na-achị steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ga-enwe nzukọ taa ebe ha ga-etikọta isi ọnụ kpebie maka ụgwọ opekatampe. Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba obodo bụ Zainab Ahmed nakwa nke na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige, ga-esonye na ya bụ nzukọ. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Jamini bụ Angela Merkel, ekwuola na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ ma oge ya gwụ n'afọ 2021. O kwukwara na ọ gaghị azọ ọkwa 'onyeisi' otu pati ya bụ CDU ọ bụ onyeisioche ha kemgbe afọ 2000, mgbe ntuliaka ya ga-abịa n'ọnwa Disemba. N'akụkọ ọzọ, A ka na-achọ ndị mmadụ ruru otu narị na iri asatọ na itoolu nọ n'ụgbọelu Lion Air ahụ dabara n'ime okeosimiri n'obodo Jakarta dị n'Indoneshia. Ka ọ dị ugbua, ezipula teknụzụ a na-akpọ sonar nakwa drone iji nyere aka chọta ma e nwere ndị dị ndụ, ebe ọ bụ naanị ngwongwo ndị mmadụ na akụrụngwa si n'ụgbọelu ahụ ka a ka na-agụpụta na mmiri ruo ugbua. N'egwuregwu, Otu Real Madrid achụọla Julen Lopetegui ụkwụ eru ala na-erughi ọnwa ise o bidoro ọrụ. Mba Spen chụrụ Lopetegui kpọ ha gaa asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018n'ọnwa Juun ka ha chọpụtara na ọ chọrọ ịhapụ ha gafee Real Madrid N'otu aka ahụ, Manchester City ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham ka ha zutere n'asọmpi Premier League n'abalị ụnyaahụ. Gee akụkọ niile a n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Ralph Uwazurike bụ onye ndu ndị MASSOB kwuru ihe o che maka Biafra nakwa ihe mere o ji kwuo na ọ bụzị ihe e ji egwu egwu. Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC" afirika-48135422,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48135422,Ernest Ezeajughi abanyela n'ọkwa 'Mayor' na Brent dị na London agba nke abụọ ya,"Ji awayị tọọ ụtọ, awanye kwuo ya ji! Otu nwa afọ Igbo ji eje mba bụ Ernest Ezeajughị abụrụla 'Mayor' nke Brent dị na mba Briten agba nke abụọ ya.","Ernest Ezeajughi: Etum si bụrụ Mayor na London. Ernest Ezeajụghị nwetaburu ọkwa ahụ nke mbụ ya n'ụbọchị nke mbụ nke ọnwa May afọ 2019 na Brent Civic Centre. N'ozi ekele nke Willie Obiano bụ gọvanọ Anambra steeti wepụtara, O kwuru na ihe Ezeajughị mere gosiri na 'Anambara steeti bụ ''ihe nke ala Naijiria"" n'ezie. Ozi ahụ nke Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ Don Adinuba binyere aka, Ọ sị ""nhọpụta a họpụtagharịrị Ezeajughi bụ ihe akaebe na ọ rụrụ ndị Brent ezi ọrụ n'agba mbụ ya."" Onye Ọgbụ n'Anambara steeti, Ernest Ezeajughị gara mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambara steeti tupu ọ gawa ala Bekee ga biri. Ezeajughi kwuru na ọ bụ nna ya gwara ya ka ọ sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime obodo ma kwe nkwa na ọ ga-atụkọta ego iji nyere ndị na-arụ ọrụ n'efu. Ọ ga-achị site n'afọ 2019 ruo afọ 2020. Ma ọ ka na-akwalite ọkọlọtọ Naịjirịa elu ebev ọ nọ. Ihe ise ị na-amaghị maka Ezeajụghị (Mayor Igbo ndị Brent) Mana dịka a na-enwe anụrị maka ọkwa ọhụrụ Ezeajughi wetere, n'okwu ọzọ ihu gbaruru agbaru. Nwaanyị mba Naịjirịa bụ Fiona Onasanya abụrụla onye mbụ a ga-eji akwụkwọ ngosi iwe akpọrọ ""recall petition"" wepụkwa ya n'oche dịka onye omeiwu na-anọchite anya Peterborough. A kpọchịrị Onasanya onye dị afọ iri atọ na ise na nga n'ọnwa January 2019 maka itụ asị gbasara ịgba oke ọsọ n'ịnya ụgbọala. Ọ bụ onye mbụ na-enweta akwụkwọ ngosi mkpesa na mba England. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 53471183,https://www.bbc.com/igbo/53471183,Isa Funtua: Onye bụdị nwoke a Nnamdi Kanu na-ekwu maka ya?,Onyeisiala Muhammadu Buhari kwara ezigbo arịrị ka o nwetara ozi na ọyị ya nwoke bụ Isa Funtua nwụrụ site n'obi nkoropu.,"Mana ozi onye ọzọ dịka onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu zitere maka ọnwụ nwoke a gbara ụwa gharịị. Content is not available End of Facebook post, 1 A ga-eli Funtua taa bụ ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julai. Bute oche ka ị mata onye Funtua bụ tupu ọ nwụọ. Isa Funtua bụ otu n'ime ndị okenye a kpọrọ (elder statesman) ndị Naịjirịa ji eme ọnụ dịka ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Buhari si depụta na Twitter ya. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya n'elu soshal midia Ben Murray Bruce bụbu sinatọ Naijiria, kwuru na ya na Funtua kpara nkata n'elekere atọ tupu e zitere ya ozi ọnwụ ya. Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche na-ahụ maka ọnọdụ ụmụ Naịjirịa nọ na mba ofesi kwuru na ọ gaghị echefu ndụmọdụ amamihe Funtua na-enyekarị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50754803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50754803,Standard Liege vs Arsenal: Arsenal ọ na-agbazi okirikiri n'ukwu ose?,"A ga-asị na Arsenal na-emezi kpọọpịị n'asọmpi ha, dịka ọ bụ ha merie taa echi ha ama afọ n'ala.","Ọ bụ eziokwu na ha a ga-efela n'agba nke abụọ asọmpi Uefa Europa mana ike adịghị ha merie 'obere agụ' Standard Liege. Ndị Standard Liege bu ụzọ nye ha goolu abụọ na nkeji 47 na 69 site n'aka Samuel Bastien na Selim Amallah. Mana ha sitere ọnwụ saa goolu abụọ ndị a site n'enyemaka Alexandra Lacazette na Bukayo Saka na nkeji 79 na 81. Asompi gosiri na 'ihe na-ebe ka na-ebe' n'ebe otu egwuregwu Arsenal nọ. Ajụjụ ndị mmadụ abụrụ 'Kedụ mgbe nke a ga-ebi?' Punch emeghi njọ ịkpọ Buhari 'Major General' - NUJ Otu jịkọtara ndị ntaakụkọ bụ Nigerian Union of Journalist ekwuola na atụmatụ ndị ntaakụkọ Punch ịkpọ onyesiala Buhari ọchịagha abụghị ihe ọjọọ N'ozi odekawụkwọ ndị otu a bụ Shuaibu Usman Leman wepụtara, ọ sị ka a hụta nke a dịka ụzọ e ji a nwụchi gọọmentị na ngada dịka iwu si kwadoo. Ọ sị na ọ dị mma ka e nye ndị ntaakụkọ ohere ịrụ ọrụ ha dite n'ịgbaso ọchịchị dị mma nke gụnyere ịkwụwa aka ọtọ, irube isi n'iwu dgz. Leman sị na nke a bụghị ịkparị maọbụ ileda gọọmentị anya dịka ọtụtụ ndị si na-eche ya. A tụọla ndị ọrụ Inec abụọ mkpọrọ Ọnụọgụgụ ndị ga-edenye aha ntuliaka ga-ebilite Ụlọikpe dị na Yola nke ọkaikpe Nathan Musa nọ n'isi ya atụọla ndị ọrụ Inec abụọ mkpọrọ afọ iri anọ na abụọ maka iri aka azụ. Ụlọikpe a nyere sị EFCC nwụchie onye bụbụ minista mmanụ agbịdị Diezani Allison-Madueke maka inye ndị a nde narị naịra atọ na iri isii na abụọ ka ha mee nrụrụaka na ntuliaka onyeisiala n'afọ 2015. Ụlọomeiwu ga-enyocha mwakpo ụlọikpe Ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Ndị ụlọomeiwu enyela iwu ka kọmitii ha na-ahụ maka ụlọikpe nyocha mwakpo a sị na ndị DSS wakporo ụlọikpe ukwu dị n'Abuja. Onyeisi kọmiti a bụ sịnetọ Opeyemi Bamidele wepụtara atụmatụ a sịte na ọtụtụ mkpesa ndị mmadụ mere. N'egwuregwu Liverpool ji akụkụ anya ha na-akpị Takumi Minamino bụ nwafọ Japan na-agbara Red Bull Salzburg bọọlụ. Dịrektọ ndị Salzburg bụ Christoph Freund dị na ha Liverpool na-akpata nkata maka orire na ọzụzụ Minamino. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọ bụ Ipob na-ekesa akụkọ na e gburu ndịagha - Sagir Musa Ndị agha Naịjirịa sị na otu ihe onyonyo na-efegharị na intanet gosiri ihe ha sị dịka ebe ndị Boko Haram a na-egbu ndị agha Naịjirịa bụ aka ọrụ Ipob. Sagir Musa bu ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa sị na ihe onyonyo a bụ arụrụ arụ ma sịkwa na ọbụghị na Naịjirịa ka o mere. Ihe onyonyo a gosiri ebe ndị dị ka ndị oyi egwu ji ụmụnwoke tupu ha agbagbuo ha. Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ N'ime akwụkwọ mgasa ozi o zipụrụ Musa sị: ""Ndi agha Naịjirịa na ekwusike na onweghi ihe ọbụla mere dị otu a. Onweghi ihe ọbụla mere dịka igbu ọtụtụ ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị iri nke ọnwa Decemba."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na nyocha ha mere ihe onyonyo a gosiri na ọ bụ arụrụ arụ. ""Ọbụghị na Naịjirịa ka ihe a mere."" Ndị agha Naịjirịa sị ka ndị mmadu gbajọọ ya bụ ihe onyonyo. BBC Igbo ka na-enyocha ya bụ ihe onyonyo. Mgbo agbara ịnụta n'ọnụ Ipob amịtaghi mkpụrụ makana ekwenti ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful agaghị. Ndị Afrịka ga-enwete 'visa' ma ha ruo Naịjirịa Site n'afọ 2020 gawa, ndị Afrịka niile ga-enwezi ohere ịbata Naịjirịa na-ejighi akwukwọ ikike Bekee kpọrọ 'visa'. Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru nke a n'Ijipt ka ọ na-ekwu okwu na nzukọ ọ gara maka udo na mmepe mpaghara Afrịka. Ya bụ Naijirịa bụzi buru akpa gị bịawa ma ịbụru onye Afrịka. Ndị ọrụ latrik akwụsịla abụbụọrụ Ndị ọrụ latrik Ngalaba na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ọkụ latrik bụ nke akpọrọ National Union of Electricity Employees (NUEE) sị na nzukọ ha na gọọmentị nwere ụnyaahụ mịtara mkpụrụ nke mere ha jiri kagbuo abụbụọrụ ha. Ụlọọrụ ọkụ Ikeja Electric dere ozi a n'akara Twitter ha: Abụbụọrụ tinyere ọtụtụ mpaghara Naịjirịa n'ọchịchịrị dịka ọkụ latrik nyụru pịnyụ. N'ozi NUEE zipụrụ n'ụtụtụ a ha sị n'ihe kpatara abụbu ọrụ gunyere: ""Ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik ekweghị ịhụ ma nsogbu anyị nwere kemgbe 2013 ha resịrị ndị nkịtị ulo na-emepụta ọkụ latrik. ""Enwekwara ndi otu anyi ruru mmadụ 2000 a chụrụ n'ọrụ akwụbeghị ụgwọ ikpeazụ."" Ihe ọzọ ha metụtara ọnụ bụ na onwere akụnauba ndị otu ha e were nye ndị a goro ulọ ọrụ na-arụpụta ọku latrik nakwa iwepu ego ezumike ndị ọrụ etu na ezighi ezi. Ntuliaka mba Briten Taa ka ọ ga-akpọtụ na mba Briten, ebe ha ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala ha. Otu onye n'ime Boris Johnson na Jeremy Corbyn ga-ama onye ga-ewere ọnọdụ ahụ mgbe a gụkọchara vootu. N'egwuregwu, Napoli ejirila Gennaro Gattuso tichie Carlo Ancelotti ha chụrụ n'ọkwa onye nchịkọta. Ebe Manchester City tetara n'ụra ka ha ji goolu anọ a satara otu, nke Gabriel Jesus nyere atọ n'ime ya, merie Dinamo Zagreb na Champions League. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: N'etiti nwoke na nwaanyị kedụ onye ka eghewe ahụ oghe n'ejije ha?" afirika-48132692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48132692,Anambra Assembly: 'Ọrịa 'Sickle Cell' a egbuchaala ndị anyị ji maka ha tinye iwu a',Ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onwe na ndị ọkaiwu akatọọla iwu ọhụrụ ndị omeiwu Anambara steeti mere nke machiri ndị bụ ọbara na-amụta ọrịa ọwọ ịlụ onwe ha.,"Ndị ụlọomeiwu Anambra Steeti nọọrọ n'ụbọchị Tuzde abalị iri atọ nke ọnwa Eprelụ mee iwu ga-eme ka ụmụafọ Anambara steeti ọbụla nyocha onwe tupu ha na-alụ dịka di na nwunye, ma machie ndị nwere ọbara ọwọ ịlụ onwe ya. Ha kwuru na iwu a a kpọrọ ""Iwu njikwa na kpochapụ ọrịa ọwọ"" bụ nke Charles Ezeani wepụtara bụ iji betala mmekpa ahụ na ọnwụ ndị ọrịa ọwọ a (Sickle Cell) na a gabiga. Ha kwuru na onye dara iwu a ga-akwụ puku narị naịra abụọ ma ọ bụ gaa ụlọ mkpọrọ afọ atọ. Mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na iwu ịmachi ndị bu ọbara na-ebute ọrịa Ọwọ(sickle-cell anaemia) megidere iwu Ala Naijiria, na ọ gaghị adị ire. Ọkaiwu Ezeh kwuru na iwu ọhụrụ ahụ megidere Akụkụ nke 37 nke Iwu Naijiria nke nyere onye ọbụla ikike ibiri onwe ya ndụ ezinaụlọ nakwa Akụkụ nke 42 nke megidrere 'ịkpa oke'. Eze onye bụ onye nkụzi na mahadum Nasarawa State University sị, ""O megidere iwu Naijiria n'ihi na Akụkụ nke 37 nke Iwu Naijiria nyere onye ọbụla ikike ibiri onwe ya ndụ ezinaụlọ."" ""Akụkụ nke 42 megidere ịkpa oke."" Eze gara n'ihu kwuo na e wezuga na ọ ga-ebute ịkpa oke megide ndị na-arịa ọrịa ọwọ, na itinye iwu ahụ n'ọrụ ga-ara ahụ. N'otu aka ahụ, onyeisi otu 'National Sickle Cell Foundation' bụ ọkanmụta Olu Akinyaju kwuru na iwu a adabaghị adaba na otu ha a nabataghị ya. Akinyaju kwuru na ụdị iwu a nwere ike iduba ndị mmadụ ime ihe dị icheiche n'ihi na ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka ndị mmadụ lụọ onwe ha. Na nkọwa ya, otu onye omeiwu na-anọchite anya Njikoka 2 na steeti ahụ bụ Pete Ibida gwara BBC Igbo na iwu a bụ iji kwụsị ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ n'oge ha kwesiri ị bara ezinaụlọ nakwa obodo ha uru n'ihi ọrịa ọwọ a. Agbamakwụkwọ abụghị ụkwa achị na'aka n'ụka Katọlik O kwuru na iwu a abụghị ka akpa oke n'ebe ndị a nọ kama na ọ bụ iji nyere ha aka. O kwukwara na ọ bụ ụfọdụ ndị nwere ọrịa a mere kpesa ka ha mee iwu dị etu a. Ibida kwuru na ha na-eche ka gọvanọ Willie Obiano tinyeaka n'akwụkwọ a ka ọ bụrụzie iwu. BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị ntoroọbịa ajụjụ ọnụ, ma ha a ga-eme nnyocha ahụ tupu ha alụọ di maọbụ nwunye. Nwada Vivian Chisom Nwabụghịogu kwuru na ihe bụ ihe mbụ ọ ga-ebu ụzọ mee tupu ọ na-alụọ nwoke ọbụla ka ha ghara ịta ụmụaka ha ahụhụ. Chisom kwukwara na iwu a ndị ụlọomeiwu mere bụ ihe ziri ezi. Nwaokoroọbịa aha ya bụ Kingsley Eṅogwe kwuru na inyocha ahụ tupu alụmdinanwunye bụ ihe dị oke mkpa. O kwuru na o kwesiri ka enyocha ma ọbara mgbali elu, ọrịa HIV nakwa ihe ndị ọzọ, nke bụ na iwu a dị mma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46589861,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46589861,Nigeria Election 2019: Onyeisiala Buhari na-arịọ ka enyekwuo ya obere oge,Akụkọ dị mkpa: Ihe Buhari chọrọ ka ọ gba r a afọ 76,"Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla ndị Naịjirịa ka ha ""do do do"" nyekwuo ya nwantịntị oge iji mejuputa nkwa o kwere ndị mmadụ. Buhari kwuru nke a mgbe ọ na-eme emume ncheta afọ iri asaa na isii (76) ya. Richard Akindele agaala mkpọro afọ abụọ Ụlọikpe ukwu dị n'Ọshụn steeti atụọla onye bụbu onye ọkammụta na Mahadum Obafemi Awolowo bụ Richard Akindele, nga afọ abụọ. Cheta na Richard Akindele rịọrịọ nwa akwụkwọ ya bụ Monica Osagie ka o nyetu ya ihe ya ka o were bulie ya n'ule akwụkwọ. Gụọ ya n'uju ebe a: Onyenkuzi OAU chọrọ idina nwata akwụkwọ ga-aracha nga afọ abụọ Mba Amerịka awakpoola Al-Shabab na Somalịa Al-Shabab na-akpa mkpamkpa na mba Sọmalịa Ka a na-ekwu nke a na-ekwu o, ndị agha ụgbọelu mba Amerịka sị na ha egbuola ndị omekataraihepụụjọ dị iri isii na abụọ (62), bụ ndị otu Al-Shabab na mwakpo ọhụrụ ha mere na Somalịa. Mba Amerịka malitere ime mwakpo kpụ ọkụ n'ọnụ kemgbe onyeisiala Donald Trump bara n'ọchịchị. Ewepụtala ka aga-esi gbaa Champions League Ebiputala aha ndị ga-ezute ibe ka asọmpi Champions League na-abanye agba nke iri na isii (16). Liverpool ga-ezute Bayern Munich, Man Utd ga-ezute PSG, Man City ga-ezute Schalke, Tottenham ga-ezute Borussia Dortmund, Real Madrid ga-ezute Ajax. Barcelona ga-ezute Lyon, Juventus ga-ezute Atletico Madrid ebe Roma ga-ezute Porto. Gee akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Boko Haram awakpoola obodo ọzọ Ndị Boko Haram wakporo otu ime obodo dị nsọ na Maịduguri, isi obodo Borno steeti ụnyaahụ. Ndị omekaome a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma chụsasịa ndị bi na ya bụ obodo akpọrọ Maiborti. Ndị agha Naịjirịa sị na ha zigara ndị agha ma ụgbọelụ ka ha chụpụ ndị oyi egwu n'obodo ahụ. Nke a na-eme ka ozi pụtara na Boko Haram gburu ndị agha iri na abụọ ụbọchị Fraịde n'obodo Gudumali dịkwa na Borno steeti. Ndị gbara ama mwakpo Gudumali kwukwara na ọtụtụ ndị agha ka na-efu. Nwodo sị ka gọọmenti nye ndi Igbo ohere ruru ha Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo adọla gọọmentị naịjirịa aka na ntị ka ọ kwụsị imegbu ndị Igbo Nwodo kwuru nke a n'emume Igbo Day emere n'Akure, isi obodo Ondo steeti. Na nkọwa ya, Nwodo sị na ndị kwesiri inwe ohere dịka ndị naijirịa ọzọ ebe ọbụla ha nwetere onwe ha na Naịjirịa. N'ofesi, Otu ICRC kwuru na ha na-enyere ụlọọgwụ ndị nwere ọtụtụ ndị ọrịa aka site n'inye ha ngwọ ọrụ Mba Saudi Arabia akatọla mba Amerịka maka mkpebi o mere ịta nwa eze Mohamed Bin Salman, maka ogbugbu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi. Ndị Saudi sị na ozighiezi etu ndị omeiwu Amerịka jiri na-ebo Bin Salman ebubo a, ma kwukwa na anya na-acha ha ọbara ọbara maka mkpebi ha banyere agha Saudi Arabia na-ebuso mba Yemen. N'asọmpị Premier league Alex Iwobi bụ nwa nwanne onye gbaburu Super Eagles bọọlụ bụ Austin Jay Jay Okocha Nwa afọ Naịjirịa Alex Iwobi ekwuola na ọ bụ etinyeghị uche mere eji merie otu ya bụ Arsenal n'asọmpị ha na Southhampton gbara ụnyaahụ. Iwobi sị na ndị Southampton gbara ọfụma, mana Arsenal achịkọtaghị obi ọnụ, nke mere ha ejighi rite mmeri na asọmpị ahu eji ọkpụ goolụ ato ha asatara abụo merịe ha. Ihe nkiri taa: Gịnị bụ 'Manage' n'asụsụ Igbọ?" afirika-45862848,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45862848,Ezekwesili: A chọrọ m ka Buhari pụta ka anyị dọrịta ụka n'ọgbọ,"Dịka o si che Buhari na Atiku aka mgba, Oby Ezekwesili ekwuola ka o ha ya n'ọnụ gbasara ntuliaka 2019.","Oby Ezekwesili: 'M ga-agba mgba dị na ndọrọndọrọ 2019' Ọ gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ụzọ ọ ga-esi chịa Naịjirịa ma ọ nweike merie. Gee n'uju etu o siri saa ya bụ ajụjụ. Oby Ezekwesili, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) mara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ pụta n'ọgbọ ka ha mee ndọrịtaụka nke a kpọrọ 'debate' na bekee. N'akwụkwọ ozi o binyere aka ya, Ezekwesili onye so ndị ndu otu Bring Back Our Girls rịọrọ ụmụ Naịjirịa ka ha aghara ikwenye ka onye ọzọ kwuchitere ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 ọnụ ha na ndọrịtaụka ọbụla. Ezekwesili chọrọ ka ya na Buhari dọrịta ụka n'ihe o mepụtara kemgbe o ji banye ọchịchị n'afọ 2015, na abụghị na osote ya bụ Yemi Osinbajo ga-adọ n'aha Buhari .""Ụmụ Naịjirịa ga-atụnyere onyeisiala, ọ bụghị osote ya. ""Ikwu okwu ndị ọzọ ịga-anọchite ndị na-azọ ọkwa onyeisiala bụ mkparị nye nde kwuru nde ndị a na-achị."" Na nsonso a, ọtụtụ ndị Naijiria na-akpọ oku ka Buhari na ndị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 nwe ndọrịtaụka, ebe ndị ihe Buhari na-amasị chọrọ ka ọ bụrụ ndị osote Buhari bụ Osibanjo ga dọọ ụka n'aha Buhari. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49804086,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49804086,Abịa State University Teaching Hospịtal: 'Ọrụ akwụghị ụgwọ ndịọrụ na ABSUTH eruola ọnwa 13',Ọrụ dibịa bekee so n'otu ọrụ kacha e nye ugwu n'ụwa niile.,"Dibia bekee A na-akpachapụrụ ndị dibia bekee anya nke ọma n'ihi na ọrụ ha dị oke mkpa n'obodo ọbụla. Mana ndị dibia bekee na-arụ n'ụlọọgwụ Mahadum Abịa Steeti (Abia State University Teaching Hospital) azaala 'Nkemdiche'. Mana 'Nkemdiche' bụkwa ajọ aha dịka Igbo si atụ n'ilu. Kamgbe ọnwa iri na atọ gara aga, ndị dọkịta ABSUTH nakwa ndị ọrụ niile na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ amaghị ihe a na-akpọ ụgwọ ọnwa dịka ha si kwuo. Ha emeela ngagharịiwe, onweghi isi, gbaa abụbụ ọrụ, onweghi isi, ha nọzi ka nwa atụrụ na-enweghị onye nche. Nnamdi Irondu gwara BBC Igbo na ha na-ata nnukwu ahụhụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa ha. Ọ bụrụ na ị biara Aba n’afọ 2014, ị ga-amata ịhe ndị anyị rụọla- Ikpeazu Irondu bụ onye mgbasa ozi otu ndị dibia bekee na ABSUTH a kpọrọ 'Association of Resident Doctors'. O kwuru na ọ bụ sọ Chukwu ma otu ha si adị ndụ kwa ụbọchị ma nwee ike ka na-arụ ọrụ. N'okwu ya: ""Ihe jọọrọ anyị nnukwu njọ ugbua maka na ọtụtụ n'ime anyị anaghị enwe ike pịkọọ etu ha ga-esi ebi ndụ n'ihi na onweghi onye ma mgbe ego ga-abata ya aka."" O kwuru na ọ bụ ihe di otu a mere ọtụtụ ndị dọkịta ndị ntorobịa ji ahapụ Naịjiria gbalaa mba ọzọ ebe e ji ndị dọkịta kpọrọ ihe. Gini kpatara oke iji ụgwọ a? Ajụjụ ndị Abịa nwere maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Irondu kwuru na gọọmentị ma ụma eji ha ụgwọ n'ihi na ha ma na onweghị ihe ha nwere ike ime. ""Anyị gbara abụbụ ọrụ n'ọnwa Nọvemba afọ gara aga, nọgide ya ruo ọnwa Jun afọ, onweghi onye tụpụụrụ anyị ọnụ."" ""Anyi mechaa lọghachikwa ka ụlọọgwụ a ghara ịnwụ kpam kpam."" Mana onye odeakwụkwọ mgbasa ozi gọvanọ Okezie Ikpeazụ bụ Onyebuchi Ememanka, kọwara na ọ bụghị gọọmentị steeti ka ọ dị n'aka ịkwụ ndịọrụ ABSUTH ụgwọọnwa. Ememanka kwuru na ABSUTH bụ ụlọọgwụ fọrọ obere ka ha kwụrụ onwe ha. Ọ kọwara sị: ""Gọọmentị na-enye ha obere ego kwa ọnwa ka ha tinye n'ego nke ha na-enweta iji wee kwụọ ụgwọọnwa."" ""Ọ bụ eziokwu na e ji ndị dọkịta ụgwọ mana amaghị m ọnwa ole e ji ha."" ""Gọvanọ ahọpụtala onyeisi ọhụrụ maka ụlọọgwụ ahụ."" ""Anyị na-eleba anya n'ụzọ a ga-esi mee ka ihe niile a bie."" Ememanka rịorọ ndị dọkịta ABSUTH ka ha ghara ịgba abụbụ ọrụ ọzọ. Nke a abụghị nke mbụ okwu iji ụgwọ ọnwa na-abolite n'Abịa Steeti. Ndị nkụzi na steeti ahụ agbabuola abụbụ ọrụ n'ihi na gọọmentị ji ha ụgwọ ọnwa iri ma mechaa kwụọ naanị abụọ. Ndị ọrụ 'Abia Poly' chọkwara ịfanye aka n'ụkwụ n'ihi na gọọmentị chụrụ ọtụtụ ndị otu ha n'ọrụ n'agbanyeghi na e ji ha ụgwọ ọtụtụ ọnwa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Idu Okwuosa" afirika-51708560,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51708560,Peer pressure: Etu ụdịrị ndị enyi ị nwere nwereike isi gbuo gị,"Ndị Bekee nwere okwu ha na-ekwu nke bụ ""ị gosi m ndị enyi gị, m gwa gị ụdịrị mmadụ ị bụ"".","Nchọpụta Suzanne Higgins na-agụ maka akparamagwa ndị mmadụ ji nrị maa atụ were sị na gị na ndị mmadụ na-eri oke nri na-erikọ nri, na ị nwereike iri karịa etu i si eribu Mana ọ bụ eziokwu na e nwereike isi n'ụdịrị enyi mmadụ nwere mara ụdịrị onye ọ bụ? Azịza ajụjụ a nwereike ịbụ ""ee"" maọbụ ""mba"", mana otu ihe bụ eziokwu bụ na ọtụtụ oge ka mmadụ na-eṅomi ma na-amụta akparamagwa dị iche iche n'aka ndị gbara ya gburugburu. Ọtụtụ oge ka ị na-amaghị na ị na-akpa agwa ndị ahụ, mana ọ ga-abụ ndị ọzọ nọ gị n'akụkụ ga-agwa gị ""enyi lekwa ihe ị na-eme, ọ dịghị mma"". Ọ bụkwa eziokwu na mmadụ nwereike ịmụta agwa ọma maọbụ nke ọjọọ, mana nke anyị na-enyobanye anya bụ ""n'ihe ọjọọ"" mmadụ nwereike ịmụta n'aka ndị enyi ya. Lee agwa ọjọọ nwereike imemila mmadụ 1) Ịṅụ mmanya: Ịṅụ mmanya adịghị njọ, mana ịṅụbiga ya oke bụ ebe nsogbu dị makana o nwereike imebi otu ihe maọbụ abụọ n'ime ahụ gị. Kedụ etu ndị enyi gị si banyekwa n'ime ya ka ị nwereike ịjụ, mana onye nwere ndị enyi ịkụ ngwọrị na-amasị nke ukwuu, onye ahụ ga-ahụ onwe ya ebe ọ ga na-eso ha na-aṅụ mmanya ma a gụrụ gụrụ. Ọtụtụ oge ọ ga-abụ n'ihi na ị chọghị ịdị ka ""onye kpe azụ"" mgbe ndị enyi gị ga na-akpọku gị ka ị bịa soro ha ṅụọ mmanya, ị gaa mee ihe ị na-akwadoghị. Nke a mere na ọtụtụ ndị nne na nna na-achọ iji aka ha ahọpụta ndị ga-abụ enyi ụmụ ha, mana kedụkwanụ maka ndị toferela ịhọpụtara enyi? Ọrịa ịṅụ oke mmanya nwereike inye gị gụnyere ọrịa akpụ, ọbara mgbalielu ọrịa shuga, ọrịa imeju dị iche iche. 2) Ise anwụrụ: Dịka ịṅụ oke mmanya, ise anwụrụ na-emebi mmadụ ahụ dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ahụike si ekwu. O nwekwara ike ibunye gị ọrịa ndị gụnyere ọrịa akpụ nke ume, ọrịa obi, ọrịa mkpọnwụ ahụ nakwa ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị na-ese anwụrụ ugbua mụtara ya n'aka ndị enyi ha, nke bụ na ụfọdụ na-ezonarị ya ezinaụlọ ha ka ha ghara ịmata. Ụfọdụkwanu esila n'ise anwụrụ ṅụwa ọgwụ ike ndị na-ebute ezigbo nsogbu. Ụfọdụ oge, ọ bụghị na ndị enyi gị ma ụma kwabanye gị n'ise anwụrụ, ọ bụrụ na ị mụtara ya site n'inọnyere ha maọbụ ilere ha anya. 3) Iri oke nri: Nchọpụta Suzanne Higgins na-agụ maka akparamagwa ndị mmadụ ebe nri nọ na mba Briten mere, gosiri na gị na ndị mmadụ na-eri oke nri na-erikọ nri, na ị nwereike iri karịa etu i si eribu Ị ma na iri oke nri na-emebikwa ahụ? Ngwanụ jụọ ndị oke ibu na-enye nsogbu. Ụfọdụ ndị buru oke ibu ugbua ebughị ya site na iri naanị nri e siri n'ụlọ ha, ọtụtụ buru ibu site n'ụdịrị ihe ha riri mgbe ha na ndị enyi ha na-eri oke nri zukọtara. Nke a bụ na ha na ndị enyi ha soro pụọ, ha erie ya ka ọ dịkwa ka ha eso n'ihe a na-arụ. Ụfọdụ bụkwa ndị ga-achọ iri ihe ọbụla ego ha ga-azụtanwu ma ha na ndị enyi ha soro pụọ, ọtụtụ oge ihe ndị ahụ a na-eri ma ndị enyi gbakọọ anaghị abụ nri dị mma n'ahụ. Oke nri nwereike ibute ọrịa ndị gụnyere oke ibu nke Bekee kpọrọ ""Obesity"", ọbara mgbalielu, bulie kọlesterọl gị, mee ka ọ na-ara gị ahụ iku ume ọkachasị mgbe ị na-arahụ ụra. 4) Agbatịghị ahụ: Ndị na-ahụ maka ahụike ekwuola na ịgbatị ahụ bụ ihe mara mma mmadụ ime, mana ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-ekwe omume. Mana ị ma na ị nwee enyi ndị ịgbatị ahụ na-amasị, ọ gaghị ara ahụ ọ gụọ gị agụụ isonye ha; nke bụ na ị mụtala agwa ọma ahụ. Ọ bụghịkwa na ọ bụ onye niile ga-anwe mmasị isonye ndị enyi ha emegharị ahụ, mana ọtụtụ ga-ejiri n'ihi akụkọ na ịkpa nkata na ọchị ha na ndị enyi ha na-enwe ma ha nọkọọ, malite iso ha aga agbatị ahụ. Ọrịa ndị nwereike ịpụta site n'agbatịghị ahụ gụnyere ndọtị akwara, ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ, ọbara mgbalielu, ụfọdụ oge ọ na-ebute ọnwụ. 5) Ịchụ nwaanyị maọbụ ịchụ nwoke: Ị jụọ ụfọdụ ndị na-achụ oke nwaanyị maọbụ ụmụnwaanyị na-eso nwoke,ihe mere ha ji eme ya ugbua, ọtụtụ n'ime ha ga-agwa gị na ha malitere ime ya makana otu enyi ha maọbụ abụọ na-eme ya. Na nchọpụta MI Norton na ndị otu ya biputara na ngalaba National Institutes of Health nke mba Amerịka, ha kọwara etu ndị mmadụ na-esikarị eṅomi ndị enyi ha n'agwa ọjọọ. Ụfọdụ malitere ime ya ka ndị enyi ha ghara iji ha mere ihe ọchị, ka ha wepụ ihere n'anya ha. Ihe ndị ọzọ nnọkọ enyi na enyi na-ebutenwu Nke a gụnyere arahụghị ezigbo ụra n'abalị ọkachasị ma ha bụrụ ndị na-emekarị mkpagharị n'abalị. Ọzọ bụ ịkpanyere ndị enyi gị nkata n'ekwentị ọkachasị n'abalị; ị bụrụ onye akụkọ na-adị mma ị gaghị achọzị ịhapụ ha gaa laba ụra. Ọzọ bụkwa na ị nwereike ịhụ onwe gị ebe ị na-emefusi ego n'ihi ụdịrị enyi ị nwere. Ọtụtụ oge, ha bụrụ ndị ""ịkụ ngwọrị"" ụwa na-atọ oke ụtọ, unu ga na-aga ebe a na-emefu ego. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?" 46258571,https://www.bbc.com/igbo/46258571,2019 Elections: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ozi Buhari na Atiku,"Site mgbe ndị ji ọkọlọtọ paatị abụọ kachasị na Naịjirịa ugbua bụ Muhammadu Buhari (APC) na Atiku Abubakar (PDP) zipuru ọzị ibido ịchụ nta vootu, social media na Naịjirịa na-eke ọkụ.","Ọtụtụ n'ime ha na-ekwusi ike na ha ga-akwado ha nke ukwu mana ọtụtụ n'ime ha na-agba ajụjụ na o nwere uru ga-apụta na nkwado ha abụọ makana ha chịala Naịjịrịa dịka onyeisiala na osote onyeisiala. Ihe ndị mmadụ dere na Twitter @Abstopsy rịọrọ Atiku ka ọ gba mbo hụ na ogbugbu mmadụ na-eme n'ugwu Awụsa kwụsịrị kpam kpam. End of Twitter post, 1 @Imhons n'ime ozi ya dere na ọ bụ eziokwu na Atiku azaghị ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gọmentị ugbua mana ozi ya na-egosi na ọ ga-edu Naịjirịa gawa elu ka ndị ndị mmadụ siri chọ Mana @UmarKani na-ebo ebubo na Atiku ga-ezu akụ Naịjirịa. @Abdoulmaleek kele osote onyeisiala maka ihe mmere na ndụ ụmụakwụkwọ ala. Mana Mon Chere dere na Buhari ga-eburu ụmụ Naịjirịa si ugwu na-agbada. Ozi Atiku Atiku agụpụtala ihe ọ ga-emere ndị Naịjirịa ma ọbụrụ na-enye ya ọchịchị n'afọ 2019. Atiku bụ onye kere okwu ya ịchafụ na Facebook nke o mere n'ehihie Mọnde gụpụtara ihe ndị a n'okwu ya. 1. Gọọmentị anyị ga-enye ọrụ gbanyụụ Anyị ga-eme nke a site na ime ka ndị ọrụaka a kpọrọ SME na bekee nke ruru nde iri na ise (50) kulie na Naịjirịa Ụlọọrụ ọrụaka ndị a ga-eme ka GDP Naịjirịa toruo njeri dọla 900 n'afọ 2025. Nke a ga-enye mmadụ ruru puku abụọ na ise (2.5) ọrụ kwaa afọ. Ndị a ga-azụkwa ihe ruru nde mmadụ n'ọrụ kwa afọ. 2. Anyị ga-ewepụta ego mgbazinye maka ndị ọrụaka Ego mgbazinye a ga-enye aka ime ka ndị ọrụaka nwete ego ha ga-eji achụ nta ego. Amụma anyi ịhazigharị Naịjirịa ga-eme ka akụnaụba steeti na gọọmenti etiti mụbawanye. 3. Steeti ọbụla ga-enweta oke ọ rụtara. 3. Anyị ga-akwụ ndị ọrụ oyibo ụgwọ ga-ezuru ha ị gbo mkpa ezinaụlọ. 4. Anyị ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwete agụm akwụkwọ bụ ọkacha akacha na mba ụwa 5. Anyị ga-enye ndị nne ahụike tọrọatọ ma mekwa ka akụ na ụba ha mụbawanye. 6. Gọọmenti anyi ga-emekwa ka ndị rụchara ọrụ bekee ghara iji egwu laa ezumike nka. 7. Anyị ga-etinyekwa ego na ịrụgharị ihe eji enyere ndụ aka dịka okporoụzọ, ọkụ na mmiri. Atiku sị na ihe ndị a abụghị nkwa ọnụefu kama ọ bụ atụmatụ ha ga-abado ma ha banye n'ọchịchị. Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. N'aka ọzọ Onyeisiala Mohammadu Buharị kwere nkwa ndị 1. Anyị ga-ahazigharị agụmakwụkwọ Anyị ga-arụgharị ụlọakwụkwọ dị 10,000 kwa afọ ma zụgharịa ndị nkuzi n ikuzi sayensi, teknụzụ, nka, mgbakọ na mwepụ 2. Rutọpụ akwa mmiri nakwa ọkporoụzọ Ha kwere nkwa ịrụpọ akwammiri Naija nke abụọ 3. Anyị ga-aga n'ihu ibu agha megide nrụrụaka 4. N'agbanyeghị oko anyị nwara n'imechi ụzọ , ọrụ ka dị n'ịhụ na nrụrụaka n'ala anyị 5. Anyị ga-emepe ohere ọrụọhụrụ rụrụ nde 15 N'ịganihu, ebe anyị ka etinye aka na ya bụ ọrụ site na ịmụba atụmatụ N-Power nakwa ọrụugbo na ndị ọrụaka. I nye ndị ọrụ ugbo na ndị na-ere ihe ọrụ site na mbuli ụmụakwụkwọ gọọmentị na-enye nrị site na nde 9.2 rue nde 15 6. Inye ịntanet n'efu na ebe ụfọdụ Ha na Google ga ejikọrịta aka ime ka enwe ịnaneti na efu n'ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ nakwa ahịaMana nkwa ndị kpalitere iwe ụfọdụ ụmụ Naijiria. 7. A ga-enye ụmụnwaanyị ọkwa ruru pasent 35 A ga-enye kwa ndị ntorobịa ọkwa na gọọmentị 8. Atụmatụ ahụike maka mmadụ niile 9. 11,000 megawat ọkụ latrik I welite ọkụ latrik megawat 1000 kwa afọ ganye na o rue megawati 11,000. 10. imepe ụlọakụ ọha Ihiwe ụlọakọ ga na-agbazinye ndị ahịa na ndị ọrụaka obere ego mgbazinye ruru otu nde naira. Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia Ha na-ajụ Buhari na APC ihe mere nkwa mbụ ha kweburu. Akụkọ ga-amasi gi Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a" afirika-48801629,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48801629,Ruga Settlement: O nweghi mpaghara ala Igbo so na Ruga - Emma Uzo,Ọtụtụ akụkọ dị n'ikuku maka ogige ndị Fulani na-achị ehi akpọrọ Ruga bụ nke gọmenti etiti chọrọ itinye ego na ya.,"E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo Ọtụtụ edemede depụtara steeti ebe gọmenti etiti sị na ha ga-amalite ile ya bụ atụmatụ nnu. BBC Chọpụtara na o nweghi steeti ọwụwaanyanwụ so na ya. Ojeozi Gọvanọ Ebonyi steeti na mgbasaozi bụ Emma Uzo kwuru hoohaa ""na o nweghi mgbe steeti Alaigbo ji soro na ya bụ atụmatụ Ruga"". Steeti tinyere aha ha na ya bụ ihe bụ ndị ugwu, mpaghara Ugwu ọwụwaanyanwụ 'North-East' na ugwu Ọdịda anyanwụ 'North West'. Emma Uzo bụ Ojeozi mgbasa ozi Gọvanọ Ebonyi steeti Gọmenti etiti kwukwara na-anaghị amanye ndị ọbụla amanye iwepụta ala ebe a ga-arụ ya bụ ogige Ruga. Onye ọkaikpe anyị gbara ajụjụ bụ Ugo Egbujo kwụrụ na steeti iri na abụọ bụ ndị akpọrọ aha ha na ya bụ atụmatụ bụ ndị gosiri mmasị na ya bụ ihe. Egbujo na-ekwụ na ""iwu Naịjirịa enyeghị gọmenti etiti ikike ịkpara ala ọbụla n'ike"". Egbujọ:'Restructuring' ka mma karịa referadum Ọ sị n'ala niile dị gọmenti steeti n'aka, bụ ndị ọ dị n'aka ilete ya anya. Gọmenti etiti ekwụọla na ha enweghi echiche ịnara steeti ọbụla ala n'ike. Ha sị na ọ bụ steeti ndị etinyeghi aha ha bụ ndị na-ebutere ya bụ emume ajọ aha. Steeti ndị so nwee Ruga 1. Sokoto 2. Adamawa 3. Nasarawa 4. Kaduna 5. Kogi 6. Taraba 7. Katsina Plateau 8. Kebbi 9. Zamfara 10. Niger. Lee ihe nkiri anyị A chọrọm ịdị ka Einstein - Ekene Franklin Ezeunala Onweghị Alaigbo sọ na Ruga Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48005948,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48005948,Arsenal vs Crystal Palace: Akụọla Arsenal isi aba okpu n'ụlọ ha,Crystal Palace mere Arsenal ọ nọ nso erughiaka dịka ha ekweghi ka Arsenal rute ha nso na goolu.,"Goolu Christain Benteke nke Crystal Palace nyere na nkeji 17 nakwa goolu abụọ ọzọ ha nyere n'ime nkeji asatọ kagburu olileanya Arsenal nwere iso na ndị ga-anọ n'ogogo anọ na tebụlụ. Dịka asọmpi a na-aga n'ihu Mesut Ozil weghachịrị olileanya ndị Arsenal na goolu o nyere na nkeji 47. Mana Everton kpọrọ ekwe nkụ na nkeji 61, imemina Arsenal dịka Wilfred Zaha nyere goolu nke abụọ ha. N'iji gbarie obi ndị Arsenal, James McArthur ji goolu o nyere na nkeji 68 gwa ndị Arsenal na ohere adịghịrị ha imeri. Pierre-Emerick Aubameyang nyeturu Arsenal obere olileanya site na goolu ya bịara na nkeji 77. Everton fooro ntụtụ taa ma kwechiri na Arsenal agaghị enyeta ha goolu ọzọ agbanyeghi na ha bịara n'ụlọ Arsenal. Mmerie Everton meriri Arsenal n'ụlọ kagburu ugboro iri Arsenal nọrọla n'ụlọ ha bụ Emirates gbaa bọọlụ a na-emerighi ha. Ugbua Arsenal na Chelsea ji ọnụọgụgụ 66 mana Arsenal ji otu ogogo kara Chelsea na tebụlụ Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47888518,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47888518,Nnamdi Kanu leaked video: Ụwa niile ahụla na gị bụ nwunye m mara mma na-ese okwu - Kanu,Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'ihe gbasara ihe onyonyo gosiri ya na nwunye ya na-efegharị.,"Kanu kwuru sị na ""Ụwa niile ahụla na gị bụ nwunye m mara ezigbo mma dịka m na-ekwukarị n'elu igwe redio"". Lee ihe o kwuru n'elu Twitter ebe a: End of Twitter post, 1 Tupu Kanu ekwuputa okwu a, BBC Igbo kpọkuru Paul Achalla bụ ọkaiwu ndị IPOB, ebe o kwuru sị ""Kanu achọghị ịtụpụ ọnụ gbasara ihe na-eme"". Achalla kwukwara sị na ""Onweghi mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo na nwaanyị anaghị amasị ya."" BBC Igbo tụpụrụ okwu ya n'elu Facebook, ka ndị mmadụ tinye ọnụ. Ụfọdụ kwuru sị na ebe ọ bụ na ọ bụ nwunye ya so ya nọrọ n'ime ya bụ ihe onyonyo, na enweghi ihe ọjọọ o mere. Ndị ọzọ na-ajụ etu ihe onyonyo a si pụta ihe, ebe ụfọdụ na-ekwukwa na ọ bụ ndị chọrọ imegide Kanu tụpụtara ihe onyonyo ahụ n'ezi. Lee ihe ha kwuchara ebe a: Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-47575704,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47575704,Dynamo Kyiv vs Chelsea: E jirila nkata goolu dulaa Dynamo Kyiv,Chelsea gosiri na ha bụ dike ọgụ n'agha ka ha tiri Dynamo Kyiv egwu ka ha abụ nwunye ha lụrụ ọhụrụ.,"Ndị Dynamo Kyiv achịtaghị aja makana ndị Chelsea enyeghi ha ohere ịṅụ mmiri tọgbọ iko. Giroud shikashịrị ka onye tetara n'ụra ma nye goolu atọ. End of Twitter post, 1 Chelsea nọ na-awụju goolu ka ọ bụ nkwado egwuregwu ka bịara, mere na goolu nke mbụ banyere na nkeji 5 e ji malite bọọlụ; oge Olivier Giroud tinyere goolu na neetị oge Willian gbara kọna. Giroud mechara nye goolu atọ n'ime otu egwuregwu a kpọro ""hattrick"", gbakpuru nke abụọ ya na nkeji 33 ma were isi takpuo nke atọ na 59, ebe Marco Alonso nyere nke ya na nkeji 45 na ụma, Callum Hudson-Odoi mechiri akwụkwọ ka ọ gbabara nke ya na nkeji 78. Serhiy Sydorchuk bụ onye ndu ndị Kyiv nwara ike ya ọzọ ka Arrizabalaga chechara goolu ya na nkeji 51, mana ọ kụrụ n'igwe poostu. Chelsea ga-amata onye ha ga-ezute n'agba anọ-ikpeazụ, n'ụbọchị 15 nke Maachị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47019229,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47019229,Nigeria 2019 Elections: Etu 'Zoning' si emetụta ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa,"Anyị ga-amalite site n'iza ajụjụ gbasara ihe ""Zoning"" pụtara. Gịnị bụ "" Zoning "" ?","""Zoning"" bụ ụzọ iwu wepụtara e ji eke ala iji hụ na ahaziri ala ndị ahụ n'ogbe n'ogbe na-enweghị mgbagwọjụ anya ọbụla. Nke a bụ nkọwa ""Zoning"" dịka akwụkwọ nkọwapụta Britannica si depụta. Na ndọrọndọrọ ọchịchị, nkọwa a na-egosi mmasị ndị nọ n'ọchịchị nwere iwulite obodo. Nke a pụtara ihe na mba dịka Briten nakwa Amerịka. Mana ọ pụtachabeghị ihe na mba ka na-etolite etolite dịka Naịjirịa. Njirimara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nwere ọtụtụ tigbuo na zọgbuo mana nsogbu kachasị bụ nkewa ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebute dị n'etiti ndị si na mpaghara ọwụwa-anyanwụ na ọdịda-anyanwụ. Day 24: Ị ga-atụnyere onye ụkọchukwu gị sị gị tụnyere na ntuliaka? Nsogbu a emetụtala achụmta vootu na Naịjirịa nke mere ka ụfọdụ ogbe hụ onwe ha dịka ndị akpachapụrụ akpachapụrụ. Ọ bụrụ na inyonye anya n'akụkọ gboo gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa , ị ga-ahụ na tupu ndị agha anara ọchịchị n'ike, ndị ọnụ na-eru n'okwu kọwara Naijirịa dịka ngalaba atọ jịkọtara ọnụ akpọrọ mpaghara ugwu , ọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ . Mpaghara ọ bụla nwere onye na-anọchite anya ha na gọọmenti etiti . Mana mgbe agha akpọrọ Civil war dachara, ụfọdụ ndị si mpaghara ndị a na-ahụta onwe dịka ndị a megbu emegbu. Kedụ mgbe ""Zoning"" bidoro ? Naịjirịa laghachiri n'ọchịchị ọhakarasi n'ọnwa May nke afọ 1999 ka afọ iri na isii ọchịchị ndị agha gafechara. Nke a mere ka ndị ọchịchị hazigharịa etu a ga-esi mee ka ọchịchị rute ogbe niile maka udo na njịkọ. Kedụ onye malitere"" Zoning"" ? Ọ bụ pati PDP kpebiri ịhazị atụmaatụ iji wee jikọta ụmụ Naịjirịa nọ gasị na mpaghara di iche iche. A na-ahụta Zoning dịka ike ikike ọchịchị onyeisiala n'etiti mpaghara dị iche iche na Naịjirịa. Nke a mere ka PDP were atụmaatụ a wee kee ọchịchị n'etiti ndị si n'ugwu nakwa ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ọ bụ okwu Zoning a mere ka pati PDP hazie ndị kwe na ndị ekweghị gbasara ogbe ga-ewepụta onye ga-achị obodo Naịjiria. Mgbe ọchịchị ọhakarasi bidochara na Naịjirịa, Abdusalami Abubakar bụ onye na-ekpe ụka Alakụba sikwa mpaghara ugwu nyefere Olusegun Obasanjo na-ekpe ụka Christ sikwa mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa ọchịchị. Ka Obasanjo chichara n'ọkwa ahụ ugboro abụọ, ọ bụ atụmaatụ Zoning mere ka pati PDP họrọ ọnye si na na mpaghara ugwu họpụta onyeisiala Umar Musa Yar'Adua bụkwa onye Alakụba. Umar mechara nwụọ, Goodluck Jonathan bụ osote ya chịtọpụrụ n'ọnọdụ ya mana mgbe ọ chọrọ ịpụta ị zọ ọkwa nke ugboro abụọ, ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ugwu jụwara isi. Dịka ntụliaka 2019 na-abịa, Zoning egosikwala ihu ya ọzọ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Duke si PDP pụọ maka Zoning Ọ bụ eziokwu na ya bụ ""Zoning"" eguzosiela ike na Naịjirịa mana ụfọdụ ndị mmadụ achọghị ya. Onye chịbụrụ Cross River steeti bụ Donald Duke kwuru na o si na PDP gaa pati ọzọ ịzọ oche onyeisiala makana PDP keneyere ndị ugwu ikike ahụ. O kwukwara na ya bụ atụmatụ adịghị mma makana o na-amụta ndị ọchịchị ọjọọ nye Naịjirịa Kedụ ka ""Zoning"" si metụta ntuliaka 2019? Pati abụọ kachasị ewu bụ PDP na APC họpụtara ndị si na mpaghara ugwu dịka ndị ga-azọrọ ha oche onyeisiala. Ndị APC họpụtara onyeisala Muhammadu Buhari ebe pati PDP họpụtara Atiku Abubakar . Ọnọdụ a ga-eme ka onye ọ bụla meriri n'etiti ha abụọ si na mpaghara ugwu chịa ruo afọ anọ. Nke a ga-eme ka ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ na-atụ anya oche ọchịchị n'afọ 2023. Ma atụmatụ a, ọ dị mma ma ọdịghị mma bụ ndọrọndọrọ nọrọ onwe ya. Ka ihe si kwuru ugbua, ọ dịka atụmatụ a dị ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ahụ mma. Akụko ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44282322,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44282322,Mohamed Salah ọ ga-agba asọmpi iko mba ụwa?,Egwu ji ọtụtụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya karịsịa ndị nkwado Liverpool na mba Egypt na Mohamed Salah maka mmerụ ahụ ya.,"Mosalah nwere mmerụ ahụ nkwapụ nku Cheta na Salah nwere mmerụ na nku aka ya mgbe Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ikpeazụ nke Uefa Champịọns nke mere eji wepụ ya n'ike. Onye nchịkọta otu Liverpool bụ Jurgen Klopp kwuru na mmerụ ahụ bụ nnukwu ihe na ọ dịka ọ gbajiri ọkpụkpụ olu. Mana otu na-ahụ maka egwuregwu na mba Egypt kwuru na ọ bụ naanị nkwapụ nku aka ka Salah nwere. End of Twitter post, 1 N'ime ihe ndị a niile, amaghị ma mmerụ ahụ ọ ga-ekwe ka Salah soro otu bọọlụ Egypt gbaa asọmpi iko mba ụwa nke dị nso nso. Ndị nyocha ahụ kwuru na ọ ga-ewe onye nwere nkwapụ nkụ izu iri na otu rue izu iri na isii iji gbakee nkeọma. Ramos kpachiri aka Salah dịka ha na-ada n'ala Kama Mohamed Salah ekwuola site n'akara twitter na instagram ya na ọ ga-esonye ndị otu gbaa asọmpi iko mba ụwa. Ọ kelekwara ndị nkwado ya maka ịhụnanya ha gosiri ya n'oge uhe mgbu a." afirika-47730118,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47730118,Pizza: Ihe asaa na-eme ihere na Naijiria na-esi mba ofesi atụbata,Mịnịsta na-ahụ maka orugbo bụ Audu ogbeh atụọla arịrị maka ego Naijiria na-emefu na ịtụbata nri na Naijiria.,"Ogbe onye kwuru nke oge ọ na-akọwara ndị omeiwu bọjeti ngalaba ya kwuru na a na-atụbata ọtụtụ ihe a na-emepụta na Naijiria gụnyere achịcha bekee a kpọrọ 'Pizza.' Dịka onyeisi ụlọ ọmụmụ ihe gbasara ibupụ ngwaahịa nke a kpọrọ 'Institiute of Export Operations na Management' bụ Udofia Ofonasaha, siri kọwara BBC Igbo , ọ bụghị naanị Pizza, ụmụ mpịapịa ihe ụmụ Naijiria na-atụbata ekwesịghị gụnyere: 1. Nghụeze: Naijiria nwere oke ọhịa nwekwa osisi e nwere ike iji mepụta nghụeze ebe ọ dị ukwu dịka ọrụ mmepụta nghụeze abụghị ihe rijuru afọ nke na e ji nka pụrụ iche eme ya. 2. Tomato mkpọ Tomato na-amị n'uju na Naijiria nke o nwere oge ọ na-ejupụta ma retọọ n'ihi enweghị usoro ichekwa ya. Mana Naijiria na-atụbata tomato mkpọ kama ịchọ ụzọ idokwa nke na-amị n'ala Naijiria. Ụfọdụ ụlọọrụ na-echekwa Tọmatọ site ịgba tọmatọ na-amị na Naijiria na mkpọ emechiela n'ihi iheisi ike na-emetụta ụlọrụ na-arụpụta ngwahịa. 3. Udara bekee Ọ na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya na a na-atụbata na ihe dịka ụdara bekee nke a kpọrọ 'apple' na Bekee nakwa mkpụrụosisi ndị ọzọ dịka unere, akwụolu na ụsụke. 4. Akị bekee Ndị Naijiria na-esi Ghana atụbata akị bekee Akị bekee dị n'ọtụtụ ebe na Naijiria mana ụfọdụ ndị Naijiria na-esi mba Ghana na-atụbata ya. 5. Igwe na-enye ọkụ na akọrọngwa igwe e ji ebi ụlọ ochie Ọtụtụ akpakara igwe ochie so n'ihe ihe ụmụ Naijiria na-atụbata. Ọtụtụ igwe na-enye ọkụ a na-atụbata na Naijiria bụ ndị ndị mba enweghị ike ịnabata n'ihi na ha ezugh ị oke. Ọtụtụ akpakara igwe ochie bụ ihe e ji enyere ndụ aka dị iche iche dịka igbe onyonyo, igwe okwu radio, kọmpụta na igwe ndị ọzọ karala nka bụ ihe ụmụ Naijiria na-atụbata. Nke a bụ na agbanyeghị atụmuche ndị ọrụ nchekwa gburugburu na o nwere ike ibute nsogbu na gburugburu. 6. Achịcha Ụfọdụ ọdọ ahịa na Naijiria na-atụbata achịcha mba France n'ala Naijiria n'agbanyeghị na Naijiria nwere ụlọ ebe a na-esi achịcha ọtụtụ. 7. Ozu ọkụkọ A na-atụbata ozu ọkụkọ na-agbanyeghị na Naijiria nwere ike izulite ọkụkọ ga-ezuru ụmụ Naijiria oriri. Ihe oke ịtụbata ihe ndị a na-ebute Na nkọwa ya, Udofia tara ma gọọmentị ma ndị ojieegoachụego na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi dịka o siri gbasa ịtụbata ihe ndị ekwesịghị ekwesị na Naijiria. Ịtụbata ụmụ mpịampịa ihe na Naijiria na-akụda Naira - Udofia Udofia nye ọkachamara na ntụbata na mbupụ ahịa kwuru na: 1. Ọ na-akụtu ọnụ Naira n'ahịa mba ụwa. 2. O na-ebute enweghị ọrụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44934492,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934492,Bukola Saraki: Ndị uweojii chọrọ ịkatọ aha m,Onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki ekwuola na oku ndị uweojii kpọkwara ya ọzọ bụ ụzọ ha ji chọọ ịkatọ aha ya n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị.,"Ndị uweojii kpọrọ Saraki ọzọ ka ọ bịa kwuo etu ohi e zuru n'ụlọakụ Offa ma gbuo ihe ruru mmadụ 17., si metụta ya; ma aka ya ọ dị ya ka ọ dịghị ya. Cheta na ndị uweojii kpọburu ya ụdịrị oku a n'ọnwa Juun, ka ụfọdụ ndị e jidere maka ohi a kpọrọ aha ya, na ọ ma maka ya bụ ohi. Saraki kwuru sị na oku a onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris kpọrọ ya bụ ụzọ e si enweta akara ọma na ndọrọndọrọ ọchịchị, nke Bekee kpọrọ 'cheap political points'. Ka ndị uweojii kpọkuru ya oku ọzọ, Saraki kwuputara okwu a site n'akwụkwọ Yusuph Olaniyonu bụ onye ndụmọdụ ya pụrụiche nakwa ọnụ na-ekwuchitere ya, depụtara ụnyaahụ. Saraki kwuru sị ""ndị uweojii ejirila ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mpụ na nrụrụaka mebie nyocha ha na-eme maka ohi e zuru n'Offa. ""Ha atụgharịala ya ịbụ ngwaọrụ pati nọ n'ọchịchị ji emegide ndị ha na-ahụta dịka ndị iro ha; ihe ha ji ata ndị mmadụ amusu ma mebie aha ha ijiri aka ha họrọ n'elu ikpookwu (platform) nke ha ga-eji chụọ ebumnobi ha, nakwa ụzọ ha si emegide ndị ọ ga-abụ ha pụọ n'APC o mebie ohere pati a na ntuliaka na-abịa."" Saraki kwukwara na ndị uweojii ekpebiela ndị a na-enyo enyo ha ga-akpọpụta n'ụlọikpe n'Ilorin, Kwara steeti na Wenesde, site na ndụmọdụ Mohammed Etsu bụ 'Director of Public Prosecution (DPP)'. Lee ihe Saraki dere na Twitter gbasara oku a kpọrọ ya. O kwukwara na ọ bụ usoro e jiri chọọ ịkwụsị atụmatụ ndị mmadụ na-ekwu na ụfọdụ ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta na-achọ ịpụ n'otu pati All Progressives Congress (APC). O kwuru na a sị na ọ bụrụ na anwụchie ya n'etiti Tuusde na Wenesde, na ọ ga-egbochi ndị mmadụ isi n'APC pụọ. O kwuru na oku a kpọrọ ya agaghị egbochi ihe ọbụla gbasara ọnọdụ ya maka ihe ga-eme na ntuliaka 2019. O kwuru na ndị na-akwado ebubo ọhụrụ a gbasara ohi Offa, ga-ada maka na aka ya dị ọcha. Saraki kwuru na ""eziokwu ga-emeri"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55455492,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55455492,"Ubong King: Nwa afọ Naịjirịa e ji okwu mkpalite mmụọ mara, a laala mmụọ",Akụkọ na-efegharị ugbu a na-ekwu na Ubong King alaala mmụọ.,"Ụlọọrụ ntaakụkọ TVC kwuru na Ubong King nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Disemba afọ 2020. Ọ gbara afọ iri anọ na asatọ tupu ọnwụ ya, dịka TVC si kwuo. Foto nwunye Ubong King tinyere n'akara facebook ya Nwunye ya bụ Unyime-Ivy King gbanwere foto ya na Facebook ma tinye ọkụ 'candle' na-enwu n'etiti ọchịchịrị iji gosi onye na-eru ụjụ O zipukwara ozi iji rịọ ndị mmadụ ka ha nyetụ ya ohere ma kwụsị ịkpọ ya n'ekwentị. O kwuru sị: ""Aga m anọrọ onwe m ka mụ na ụmụ were nwayọọ gbarie ihe a na-emenụ."" ""Naanị ihe m nwere ikwu bụ na Ọdịmnobi Ubong King arụzuola ọrụ Chukwu zitere ya ka ọ rụọ n'afọ iri anọ na-asatọ ọ nọrọ n'ụwa, ugbua ọ nọ n'udo."" Onye bụ Ubong King? Ubong Thompson King bụ onye a ma ama na Naịjirịa niile maka okwu mkpalite mmụọ nke Bekee kpọrọ 'motivational speaking'. Ọ bụ onye na-akpagharị n'ebe dị iche iche na-agwa ndị mmadụ okwu ga-enyere ha aka ịgbanwe ndụ ha. Ọ na-agakwa n'ụlọọrụ dị icheiche inyere ndị mmadụ aka ma kuziere ha ụzọ ha ga-esi mee ka ụlọọrụ ha na-abawanye, nakwa etu ndị ọrụ ha ga-esi kawanye mma. Bekee na-akpọ ụdị ọrụ a 'Business coach' maọbụ 'Life Coach'. Ihe ọzọ e ji mara Ubong King bụ 'Trouble Maker' Ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Ubong King Ubong King kọrọ akụkọ ụwa ya n'ihe onyonyo o tinyere n'akara Youtube ya. Lee etu o si kọọ ya: Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ubong King Kate Henshaw onye na-eme ejije kwuru na Ubong bụ ngọzị nyere ya Ọgba egwu a ma ama bụ Kaffy kwuru na Ubong King metụrụ ndụ ya aka n'ụzọ pụrụ iche" afirika-53157342,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53157342,Igbo Slangs: Lee okwu ogbe naanị ndị nwere anya n'azụ nwere ike ịghọta,Onye ọbụla toro n'Igbo mara na o nwere ụfọdụ okwu na-efefere ndị Okenye n'isi maọbụ gbagwojuo ndị amaghị nke a na-akọ anya.,"Ọ bụghị na okwu ndị a abụghị okwu Igbo, kama ha bụ okwu ndị toro n'Igbo ji agwa ibe ha okwu n'okporo. BBC Igbo tụlere ụfọdụ n'ime ha nakwa etu ha si pụta ma bụrụ okwe ogbe. 1.'Akụkọ n'egwu Mike Ejeagha' Akụkọ n'egwu Mike Ejeagha Ị nụtụla ka mmadụ kwuchara okwu, a sị ya na ""ị na-akọ akụkọ n'egwu Mike Ejeagha""? Ama m na i ji uche ghọta na ihe a na-ekwu bụ na ị na-akọ ihe emeghị eme, ihe agaghị emenwu maọbụ akụkọ ifo. Mana ị ma na Mike Ejeagha bụ mmadụ dị ndụ na-eku ume rue taa? Ejeagha, onye Ezeagụ n'Enugwu steeti, bụ onye otiegwu a ma ama egwu ya wuru ewu na 70s na 80s. Akụkọ (ifo) na egwu bụ ihe e jiri mara ya bụ nwoke ahụ bụ ọkpụisi tupu ya abanye iti egwu. Ụfọdụ egwu ọ gụrụ gunyere Elulube lube na Ome ka agụ. Pịa ihe onyonyo ka ị hụ ihe ọ gwara BBC Igbo maka ndụ ya: Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha 2.""Holy Nwejeh!"" ""Ị nụkwa! 'Holy Nwejeh'! Santa Nwegbe! Nsọ nsọ, ebube ebube."" Ị nụ ụdịrị okwu a bụ okwu akọmọnụ, ị mara na onye na-ekwu ya na-akwa gị emo. Ihe onye ahụ na-agwa gị bụ na ị na-eme ka ị dịka nsọ. Mana 'Holy Nwejeh' abụghị okwu ntufu, ọ bụ mmadụ ka ọ bụ; onye ụkọchụkwụ Anglịkan a kpọrọ Hezekiah Okoro Nweje. Dịka Timothy Ofoegbu, onye Anambara siri kọwaa, Hezekiah Okoro Nweje, onye Ọnịcha, Anambara steeti bụ onye a ma ama dịka 'Holy Nwejeh' n'ihi ezi omume ya na okwu ọnụ ya nakwa omume. A maara ụkọchukwu ahụ bụ onye a mụrụ n'afọ 1919 maka ị na-enyere ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka. Umeala ya enweghị atụ nke bụ na oge e nyere ya ohere ka ọ bụrụ bishọpụ ụka Anglịkan na mpaghara Niger, ọ jụrụ ma kpọpụta aha onye ọzọ o chere na ọkwa ahụ ka kwesị. A bara otu okporoụzọ 'Nwejeh' n'Ọnịcha iji kwanyere nwoke ahụ nwụrụ n'afọ 1962 ugwu. 3. ""Ị maruru Chike Obi na Maths?"" Chike Obi ""Ọ ma akwụkwọ, ọ ma akwụkwọ, ọ maruru Chike Obi?"" Chike Obi, bụ nwa afọ Igbo ụbụrụ ya na-acha ọkụ na mgbakọ na mwepụ nke Bekee kpọrọ, ""Mathematics"". Ọ bụ Ọkammụta Mathematics na Mahadum University of Lagos. Lee ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka odogwu ahụ n'ime akụkọ a: Chike Obi: Odogwu Igbo ji 'mathematics' rie amusu 4. ""Upe! Onye Ọma Emeka"" Gị na mmadụ ekwutula okwu, ọ kpọọ gị, ""Onye ọma Emeka'? Ihe ọ na-achọ ịgwa gị bụ na ya achọghị alo ahụ ị na-atụnyere ya. Mana ị ma na okwu ahụ si n'aha otu akwụkwọ Igbo ndị Prịamarị na Sekọndịrị nke Mmụọtụlụmanya J Okafọ dere? Akụkọ ahụ ga-akọwara gị ọfụma ihe aha ahụ pụtara. 5. Ị tara akwụ ka ọ bụ etu eze gị dị? Ihe ọ pụtara bụ na ị na-eme ihe atụghị anya n'aka gị. Iji maatụ, i kwe mmadụ ahịa ọnụ ihe erughị ihe ọ zụrụ ya, o nwereike ịjụ gị, ""Ị tara akwụ ka ọ bụ ka eze gị dị?"" 6. ""Ị hụla Beatie"" maọbụ ""ị na-agwa Beatie"" Beatie bụ mkpọbiri aha Bekee bụ Beatrice, nke a na-agụ ụmụnwaanyị. O nweghị onye ma Beatrice nke a na-ekwu maka ya mana ihe ọ pụtara bụ na ihe i kwenyeghị n'ihe onye na-agwa gị na-ekwu maọbụ na onye na-agwa gị okwu kpọrọ gị onye amaghị ihe. 7. Reverend sista etinyela traụza Chiwetalu Agu Mmadụ tie na ""Revered Sister etinyela Traụza"" ihe ọ pụtara bụ na ihe atụghị anya emeela. Mana Ị ma na ọ bụ ome ihe ejije Nollywood bụ Chiwetalu Agu bụ onye e ji okwu ahụ mara? A ma ya dịka onye na-atụpụta okwu ọchị mana ọtụtụ mgbe uche na-adị n'okwu ya. Ụfọdụ okwu ogbe sirila n'ọnụ Agu pụta gụnyere: ""Udele anyụọ nsị n'ọlta!""; ""Aka ose adịghi mma n'otele"" Wdg. 8. Afọ nsị Onye buru ibu mana o nweghị ume maọbụ agba. 9. 'I ga-ahụ nke tọrọ fada' Ihe okwu a pụtara bụ na ị ga-enweta nnukwu ntaramahụhụ. 10. 'Igbu ozu' maọbụ 'ibute ike' Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ego Igbo ejighị ego maọbụ ihe ego ga-azụtali egwu egwu. E nwere ọtụtụ okwu ogbe metụtara ego. ""O gbuola ozu""; ""Ọ pọtọọla"", ""O nwere ego igwe,"" nke pụtara na onye ahụ abaala ọgaranya ngadanga. Ụfọdụ oge, a na-eji ụdịrị okwu a akọwa onye nwere ego amaghị ebe ego ya si, dịka a sị na ""ego ya bụ ego mbute"". N'aka nke ọzọ, ""Owu na-asa m"" bụ okwu ogbe e jiri mara ndị bi n'Ọnịcha, Anambara steeti pụtara na ""ego kọrọ m"" Okwu ogbe ndị ọzọ metụtara ego gụnyere: ""Kpapụtara anyị ya ka o sie,"" maọbụ ""Gbachaa m arụ"" maọbụ ""Meka sịa"" pụtara, ""chọrọ anyị ihe (ego)."" Okwu ogbe ndị ọzọ bụ, ""Nwanne, e kogo m"", ""ife a sị"", ""nothing mega"", ""ị ma ife a na-arụ"", ""Ị makwa ndị anyị bụ"", ""ịgba apiriko"" wdgz. N'ezie, anyị agaghị edepụtachali okwu dị a n'ihi na ha dị agụta ọnụ. Gwa anyị nke a na-ekwu n'ogbe gị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-53349839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53349839,Magu o kotere akpa ebu ga-agbakasị EFCC ahụ?,Ide okwu banyere ọchịchị Ibrahim Magu - bụ onye na-arụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka a kpọrọ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) na Bekee - ka na-ede dịka a na-atule onye ga-anọchite anya ya.,"Dịka ọ kwụ ugbua, Magu ka nọ n'aka ndị uweojii dịka akụkọ na-ekwu na a gaala be ya ime nnyocha banyere ebubo na ọ rụghị ọrụ ya etu o kwesịrị. Mana ebe okwu a na-aga karịsịa bụ etu ihe a Magu na-agabiga ga-esi metụta agha gọọmentị Muhammadu Buhari na-ebuso mpụ na nrụrụaka. Nicholas Ibekwe bu onye ntaakụkọ e ji ime nnyochapụta ihe zoro ezo mara, gwara BBC na azịza ọhụrụ na-azacha ụlọ karịa nke ochie, nke pụtara na onye ọhụrụ ga-anọchi anya Magu ga-eji usoro ọhụrụ bata. Ibekwe kwuru sị: ""Onye ahụ ga-esi n'etu Magu jiri rụọ ọrụ mụta usoro ọ ga-esi rụọ ọrụ nke ya."" ""Anaghị m asị na ikpe mara Magu, mana ọ ga-abụrịrị na o nwere ebe o si zọghie ụkwụ."" ""Onye ọhụrụ ga-ama etu o ga-esi ghara ime ụdịrị ihe ahụ"" Ọ gakwara n'ihu kwuo na ihe ọzọ bụ na o nwere ụfọdụ mkpesa ndị mmadụ kpesaara EFCC ha ebughi gaa n'ihu, nke mere ka ụfọdụ na-eche na ọrụ ha bụ ibuso ndị ekwenyeghị na gọọmentị agha. ""E nwere mkpesa banyere ụgbọala ego bara be Sinetọ Ahmed Tinubu tupu e mee ntuliaka nke afọ 2019."" ""E nwere nke e kpesara banyere etu Babatunde Fashola siri chịa steeti Legọs ka nọ na ngịga."" Ibekwe kwukwara na oge e wetara mkpesa megide Ọkaikpe Ukwu Naijirịa bụ Walter Onnoghen, EFCC buuru ya gaa n'ihu nke mere ka a chụọ ya n'ọrụ. Maazị Ibekwe che na otu ihe onye nọchiri anya Magu nwereike mee ọsịsọ iji mee ka ezigbote ọganihu dị na EFCC, bụ ịkwụsị ime agha mpụ na nrụrụaka ihe egbe ọnụ a na-agba n'elu akwụkwọ mgbasaozi. Ọ sị na ọ bụghị na ya nwere olileanya na onye nọchitere anya Magu ga-eme ọfụma, mana ọ na-eche na o ruola oge EFCC agaghịzị abụ ihe e ji ebuso ndị amasịghị gọọmentị agha. Ibekwe kwuru: ""Nke bụ eziokwu bụ na ma oge ndị mmadụ ka na-eto EFCC, n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo, a ma na e ji ha ebuso ndị gọọmentị ahụghị n'anya agha, mana o ruola oge ụdịrị ihe ahụ ga-akwụsị. Ka a hụ EFCC dịka ihe toro etu o kwesịrị."" Ihe a sị na Magu mere? Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti Ebubo Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami wụkwasara Magu n'isi gụnyere:" afirika-46344453,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46344453,"""Baby Mama"" abụghị omenaala Igbo",Na nwaanyị mụrụ nwa na-alụbeghị di abụghị akụkọ ọhụrụ na Naịjiria .,"Ihe na-agbagọju ọtụtụ mmadụ anya bụ na ọ dịzị ka ndị ntorọbịa agba ọhụrụ na-aṅụzi ya bụ omume. Otu onye so na ndị na-ahụ na ụmụ ntorọbịa anaghị ebi ndụ efulefu n'obodo bụ Oriakụ Nkiruka Onyekozuru-Okafor kwuru na ya bụ agwa a kpọrọ ""Baby Mama"" abụghị omenala Igbo. Nkiru kwuru na ihe ọjọọ gbara afọ a pụtaghị na ọ bụrụla omenaala. Cheta n'akụkọ wuru na soshal midia kwuru na-ekwu na Flavour bụ otiegwu ama ama na nwata nwaanyị mụbụrụ ya nwa bụ Sandra Okagbue amụtala nwa ọhụụ, nwa nwoke. Flavour onye ezi aha ya bụ Chinedu Okoli Lee ndị ama ama ndị ọzọ nwere ""baby mama"" na Naịjiria: Tuface Idiabia Onye otiegwu, Innocent Idibia nke a ma ama dịka Tuface nwere ụmụ nwaanyị anọ mụrụ ya ụmụ ya asaa tupu ọ lụa Anne bụ nwunye ya ugbua. Ha gunyere Pero Adeniyi na Sunbo Adeoye. Davido Davido bụ ya tiri egwu a kpọọ 'Assurance' Ọtụtụ mara na Davido na Chioma bụ nnu na ose, mana ụfọdụ amaghị na Davido ,onye ezi aha ya bụ, David Adeleke, nwere ụmụ nwaanyị mụrụ ya nwa. Sophia Momodu, nwa nwanne, Dele Momodu oney nwe ọ́kwụkwọ akụkọ, Ovation, mụrụ Davido nwa. Onye ọzọ mụrụ ya nwa bụ nwaanyị a kpọrọ, 'Amanda.' 9ice 9ice, onye otiegwu ọzọ ama ama amụọla ụmụ ise n'aka ụmụnwaanyị anọ gunyere Olasukanmi Ajala na Vicky Godis. Toni Payne nwunye ya na ya gbasara afọ ole na ole gara aga mụttara ya otu nwa nwoke. Wande coal Wande Coal nwere otu nwaanyị a kpọrọ Tope Ogunnusi, onye mụtara ya nwa nwoke. Wizkid ụmụnwaanyị mụtara Wizkid nwa na alụghị ya alụ gụnyere Shola Ogudu,Jada Pollock nakwa Binta Diallo. Sean Tizzle Alụbeghị nwaanyị mana o nwere nwa otu enyi ya nwaanyị a kpọrọ Maina mụtara ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45088456,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45088456,Kedu ebe osote gọvanọ Akwa Ibom kwụ?,"Ugbua bụ oge ntụgharị n'ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ, nke mere onye achọrọ n'elu akwa n'abalị, ebube agaghị ada ma ahụ ya n'ezi.","Ekpo si na ya ka kwu chim na PDP Ya mere ndị mmadụ ji a sị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwupụta pati ha kwụ n'azụ. Nke na-eme ugbua bụ na osote gọvanọ Akwa Ibom steeti bụ Moses Ekpo, bụ onye a sị tichara aka na ọkpa wee tinye akwụkwọ arụkwaghịm ụnyaahụ. Maazị Ekpo, onye ndị ntaakụkọ ụfọdụ kwuru na ọ ga-esoro onye bụbu gọvanọ steetị ahu bụ Godswill Akpabio gafe pati APC, bụkwa onye akụkọ na-ekwu na ọgọrọla ụkwụ na aka. Ekpo kwukwara na ya ka nọ na pati Peoples Democratic Party (PDP). Ọnu na-ekwuru Ekpo bụ Ekikere Umoh bu onye kwuru nke a. Ọ si na njem Ekpo gara ugbua bụ ozi aka na-achị steeti ahụ bụ Udom Emmauel ziri ya. Ozi a metụtara nzụkọ ndị Ati Annang nwere na obodo New York dị na mba Amerịka. Cheta na akụkọ nọ n'ikuku na-ekwu na Godswill Akpabio na-ejikere ị maba pati na-achi Naịjirịa bụ APC. Unyaahụ, Akpabio na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere mkparịtaụka na London. Mana, ka ndị mmadu ka na-eme ka ha ọghọta ihe nzụkọ ahụ pụtara, foto pụtara na Twitter na-egosi ya na onyeisi APC bụ Bola Tinubu. Amabeghi etu okwu a ga-esi gaa, mana etu obụla asị gba ya bụ egwu, anya anyị ga-adị na ya, ịhu na unu nụrụ ya." afirika-44399349,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44399349,"A tụola nwoke nga maka igbu ndị mụrụ ya, nwanne ya",A tụọla otu nwoke nga mkpụrụọka maka igbu nne na nna ya nakwa nwanne ya nwoke na mba Saụt Afrịka.,"Van Breda kwudosiri ike na-ekwu na ọ bụ otu onye kpu ihe n'ihu kpara mkpamkpa ahụ Henri Van Breda,onye ji onike gbuo ndị ezinaụlọ ya n'ụlọ ha na Janụwarị afọ 2015 ga-agakwa mkpọrọ afọ iri abụọ na ise maka ịnwale igbu nwannne ya nwaanyị ọ tọrọ. Oge a na-ekpe ya ikpe, Van Breda kwudosiri ike na-ekwu na ọ bụ otu onye kpu ihe n'ihu kpara mkpamkpa ahụ. Na mkpebi o nyere n'ụlọikpe ukwu dị na Saụt-Afrịka ụbọchị Tọọsde, ọkaikpe Siraj Desai kwuru na mwakpo e mere ezinaụlọ Van Breda bụ 'ọchụ ka ọchụ.' Ọkaikpe ahụ kwuru na nwoke ahụ egosighị nchegharị ọbụla oge niile ikpe ahụ na-aga nke o ji agwakwanụ onye ọbụla ihe mere o jiri gbuo ndị ezinaụlọ ya. Mana ka o si dị, ụdị mwakpo a tụrụ ndị nyocha na ndị Saụt Afrịka n'anya. Ọtụtụ na-eche na mkpebi a ụlọikpe nyere ga-abụ amamọkwa nye ndị ga-abụ ndị omekome. Henri Van Breda, onye nke mara ihu akpụ oge ikpe na-aga, ga-agbagharị akwụkwọ mkpegharị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49493807,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49493807,US Visa Fee: Nigeria ebutuola ego ole ndị America ga na-akwụ maka 'visa',Akụkọ si na mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo na-akọwa na ha ebutuola ego ole ndị mba Amerịka ga na-akwụ maka 'visa' tupu ha abata Naịjirịa.,"Amerika were udi ụlọọrụ a n' Abuja na Lagos Nke a na-abịa ka naanị otu ụbọchị ndị mba Amerịka buliri ụgwọ Naịjirịa ga na-akwụ maka inweta 'visa' nke ha, gachara. Maka nke a, mịnịsta na-ahụ maka ngalaba ahụ bụ Rauf Aregbesola, nyere iwu ka e butuoruo ego ahụ dọla 150, malite n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst 2019 a. Lee ihe ha dere na Twitter: NEMA: Mmadụ 153 ka e si mba Libya Kpọlata Mmadụ otu nari iri ise na atọ ndị tọọrọ na mba Libya bụ ndị lọghachiri Naijiria ụbọchị Wenezde site n'ọdọ ụgbọelu Muritala Muhammed Airport dị na Legos. Onye nọchitere onyeisi ndị ngalaba gbatagbata bụ National Emergency Management Agency bụ Slaku Lugard nabatara ndi a gụnyere ụmụnwanyị iri ise na itoolu, ụmụnwoke iri asaa na asatọ na ụmụaka iri na isii. Ha bubu n'obi isi mba Libya gaa Yurop. State emergency Management Agency nke Anambra Steeti amaala ọkwa nkwucha idemmiri Ndị niile bi na ikpere mmiri kwado ikwapụ maka idemmiri. N'aka nke ọzọ, ngalaba anabatala nke Anambra steetị amaala ọkwa ka ndị obodo niile bi na ikpere mmiri kee nkwụcha ma kwadowa ịkwapụ maka idemmiri na-abịa. Ọ bụ odee akwụkwọ SEMA bụ Paul Odenigbo kwuru nke a na ọgbakọ e nwere na Ụmụmbo dị na Ayamelu, Awka, Anambra steeti na nso nso. N'Ofesi Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth nke 11 enyela ntụziaka ka a kwụsịtụ ụlọọmeiwu mba ahụ ọrụ. Ihe nke a pụtara bụ na ndị ụlọomeiwu mba ahụ agaghị enwe ike ịkpakọrịta maka mpụta mba Briten n'otu European Union na enweghị nkwekọrịta ọbụla n'abalị 31 nke ọnwa Oktoba. N'Egwuregwu Ndị na anọchite Naịjirịa na asọmpị 'African Games' nke 2019 Naịjirịa agbagotela n' ọkwa ihe nrite nke African Games were bụrụ onye nke anọ. Naịjirịa ji ihe nrite iri ise na abụọ nke gunyere olaedo iri abụọ, ọla ọcha iri na isii na ọla nchala iri na isii. RevolutionNow: Ụlọikpe jụrụ inye iwu ka a tọghapụ Sowore Omoyele Sowore, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha otu AAC sọ n'isi sekpụ ntị ngagharịiwe #RevolutionNow Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nọrọ ụbọchị wednezde jụụ ikwenye arịrịọ nke Omoyele Sowore rịrọrọ ka a kagbue njichi ndị uweojii bụ DSS n'aha ịchafụ jichiri ya. Ụlọikpe ọzọ dịkwa n'Abuja nọbụ n'abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst nye DSS ikike ijichi Sowore abalị 45, nke a mere dịka DSS rịọchara ka enye ha abalị 90 iji mee nke a. Ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Jọstịs Evelyn Maha kwuru na ya enweghị ike iwezụga mkpebi nke ụlọikpe ọzọ nke nyeburu DSS ikike ijichi Sowore rue abalị 45 iji nye ha ohere inyocha ya maka ebubo iyi egwu. Ọ gwara ha ha lọghachi n'ịụlọikpe ebe ndị DSS nwetara mkpebi ka ha lebanye anya n'okwu ahụ. Cheta na ndị DSS nwụchiburu Sowore n'abali foro Ọgọst 5 bụ ụbọchị e hiwere ngaghariiwe RevolutionNow. Ezughi m ego ndị Abia - OUK Aka Chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu agọrọla ọnụ ya n'ụlọikpe n'ime ebubo izu ego dị ijeri naịra asaa na ụma nke ụlọọrụ mgbochi nrụrụaka bụ ""Economic and Financial Crimes Commission"" (EFCC) boro ya. Kalu kwuru na Abia Steeti enweghi ụdị ego ahụ n'oge ọ nọ n'ọchịchị. O kwuru nke a n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs ebe ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ ya na ụlọọrụ ya bụ Slok nakwa onye direktọ akụnaụba Abia Steeti n'oge ahụ bụ Jones Udeogu. N'okwu ya ""Abia Steeti enweghi ụdị ego ahụ, oge m na-apụ n'ọchịchị, anya gbaziri ego kụọ ụgwọ ọnwa. ""Ego a na-enye Abia Steeti kwa ọnwa mgbe m bara n'ọkwa n'ọnwa Juun 1999 bụ nde naịra 168."" Ikpe a dị n'etiti EFCC na Kalu a nọọla afọ iri na abụọ. Gọọmentị etiti na ụlọọrụ P&ID Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-aga na mba Amerịka gbaghaa ikpe ụlọikpe dị na mba Briten kpere sị ka ọ kwụọ ụlọọrụ ""Process and Industrial Developments"" (P&ID) ego dị ijeri dọla itoolu na ọma Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed kwuru na Naịjirịa agaghị atufu akụnaụba nye ụlọọrụ ahụ. N'ofesi Ndị ogbunigwe mgbagbuonwe e che na ha bụ ndị otu Islamic State wakporo ebe nnyocha ndị uweojii na Gaza dị na mba Palestine ma gbuo mmadụ atọ n'ime ha. Otu n'ime ndị ogbunigwe mgbagbuonwe a nọbuuru n'aka ndị uweojii n'oge mbụ. N'egwuregwu Otu egwuregwu Inter Milan ekwela ịgbaziri Alexis Sanchez site n'aka ndị Manchester United. Onye nchịkọta Inter Milan bụ Antonio Conte chọrọ ime nke a tupu a pịachie akwụkwọ ịre na izụ ndị ọgba bọọlụ nke afọ a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka." afirika-46717643,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46717643,2018 Highlights: Agbamakwụkwọ ndị akpụ n'ọnụ n'afọ a,Agbamakwụkwọ bụ otu emume na-ebute aṅụrị ebe niile mana ihe dị ịche na-adị na ha.,"Iji maatụ, n'ime ndị niile gbara akwụkwọ n'afọ a, naanị ụfọdụ mara ebe niile jijiji. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: 1. Linda Ejiofor na Ibrahim Suleiman Ndị na-eme ihe onyonyo 'Tinsel' bụ Linda Ejiofor na Ibrahim Suleiman, ji ""#ISquared2018"" wuo ewu mgbe ha lụrụ onwe ha n'ọnwa Nọvemba. 2. Ọkparaeze Harry na Meghan Markle Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Agbamakwụkwọ ha mere ụbọchị 19 nke ọnwa Mee, wuru ewu mere na akọchabeghi maka ya ruo ugbua. 3. Francis Uzoho na nwunye ya Onye ọgba bọọlụ otu egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa bụ Francis Uzoho, dị afọ 20, gbara nwkụ nwaanyị ya n'Imo steeti n'oge ekeresimesi na Naịjirịa. 4.Gbemi Olateru-Olagbegi na Femisoro Ajayi #TheGFShow bụ ọzọ wuru ewu mgbe onye ntaakụkọ n'igwe okwu bụ Gbemi Olateru-Olagbegi na onye nchịkọta otiegwu 'Falz' bụ Femisoro Ajayi gbara akwụkwọ. 5. Chris Attoh na Bettie Jenifer Mgbe ya na nwunye ochie ya bụ Damilola Adegbite gbachara alụkwaghịm, Chris Attoh, onye Gana bụ ome ihe nkiri a ma ama, mere ihe tụrụ mmadụ niile n'anya mgbe ọ lụrụ Betrite Jennifer. 6.Fatima Dangote na Jamil Abubakar Njịkọ nwa ọgaranya bụ Aliko Dangote nakwa Jamil Abubakar, butere ihe yiri ala ọmajiji n'obodo Legọs. Nke bụ na o butere ide ji ego bụ Bill Gates, nakwa onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Addo, so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara agbamakwụkwọ a. 7. Priyanka Chopra na Nick Jonas Priyanka Chopra bụ ezenwaanyị mma nakwa omeihe onyonyo na mbaụwa niile lụrụ onye otiegwu mba Amerịka bụ Nick Jonas na mba India. Mmemme e mere iji kwado ya bụ agbamakwụkwọ ruru otu izuụka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57314327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57314327,Fr Ebube Muonso: Gọọmentị kwesịrị iji 'sit-at-home' Nnamdi Kanu tinyere wee mụrụ akọ,"Emmanuel Obimma, ụkọchukwu ụka Katọlik e ji Ebube Muọnsọ mara, ekwuola na ihe mere n'ụbọdchị Mọnde n'ihi atụmatụ 'sit-at-home' Nnamdi Kanu tinyere, ekwesịla ịkuziri gọọmentị etiti ihe.","Ebube Mụọnsọ kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere pụrụ iche o nwere n'ụbọchị Mọnde iji kpee ekpere maka ọgbaaghara na-ada n'elu n'ala na Naịjirịa. N'ihe onyonyo ekpere a nke Fada Ebube Mụọnsọ tinyere na soshal midia ya, o kwuru na Nnamdi Kanu bụ nnukwu mmadụ nke a na-ahụbeghị ụdị ya n'ụwa a. O kwuru sị: ""Gọọmentị etiti ma ihe ha kwesịrị ime ka ọgbaaghara ndị a kwụsị, mana ha ma ụma na-eme ka ha amaghị."" ""Ọ bụrụ na nghọta adịghị, udo agaghị adị."" ""Achọrọ m ịgwa ụwa niile na Nnamdi Kanu bu nnukwu mmadụ. Ndị dịka ya ebughị ibu n'ụwa a."" ""Naanị otu mkpụrụ iwu o nyere sị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ, onye ọbụla edere duu."" ' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ ""I lee anya, ọtụtụ ndị otu anyị anọghị ebe a ... n'ihi iwu Nnamdi Kanu nyere sị onye ọbụla 'sit at home'."" ""Ihe m chọrọ ịgwa ndị mmadụ bụ na enwere mmụọ na-akwado okwu nnwereonwe Biafra a."" ""Ya mere m ji arịọ gọọmentị etiti ka ha na ya nwee mkparịtaụka ugbua tupu ihe akawanye njọ."" Ebube Mụọ nsọ ""Ọ bụghị oge niile ka ekwesịrị iji aka ike iji nweta udo."" ""Gọọmentị etiti kwesịrị ịghọta nke a ma kpọghachi Nnamdi Kanu azụ iji nwee mkparịtaụka."" ""Ọtụtụ mmadụ ejirila ndụ ha chụọ aja maka ndọrọndọrọ a, ya mere ọ gaghị adị mfe ịkwụsị."" ""Ọtụtụ ka dịkwa njikere iji ndụ ha ghọrọ mgbọ iji chekwaa Nnamdi Kanu."" ""Ike agwụla ndị mmadụ. Ọtụtụ enweghị ọrụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa enweghizi olileanya."" Fada Ebube Mụọnsọ kwuru na ọ bụ otu a ka mba ụwa si gbachi Hitler nkịtị ruo oge o gburu ndị Juu karịrị nde isii. Ọ gara n'ihu kwuo na ya na-ekpe ekpere ka udo na ịhụnanya chịa na Naịjirịa. Ihe Ohaneze ndị Igbo kwuru maka 'sit-at-home' e mere n'ala Igbo ụnyahụ Ndị Eze Igbo Onyeisi ọhaneze ndị Igbo bụ George Obiozor site n'ọnụ okwu okwu otu ahụ bụ Alex Ogbonna ekwuola na sit-at-home unyahụ gosiri na obi adịghị ndị Igbo mma maka mmegbu gọọmenti etiti na-emegbu ha. Ogbonna kwuru na etu ndị Igbo si rube isi maka iwu onye nọrọ n'ụlọ ụnyahụ(May 31, 2021) gosiri na ndị Igbo ga-ejinwu otu obi mepụta ihe. O kwukwara na ndị Igbo ji ohere ahụ wee chetekwa nwanne ha nwụrụnụ n'agha Biafra mere na 1967 ruo 1970. Ogbonna kwuru na ndị Igbo enupughị ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu isi site n'ime atụmaatụ 'sit-at-home' ndị Indigenous People wepụtara kamana ndị Igbo chọrọ ka ndị gọvanọ ha wegara Abuja ozi ha na obi adịghị ndị Igbo niile mma. O kwuru na o kweteghị na ọ bụ ụjọ mere ka ndị mmadụ dowe iwu ""sit-at-home"" makana ndị mmadụ pụtara taa bụ June 1,2021 bụ ụtụtụ fotere abalị May 31st. Etu o si metụta ndị na-azụ ahịa n'ala Igbo Innocent Chukwuma e ji Innoson mara bụ oji ego achụ ego Chukwuma kwuru na iwu nọrọ n'ụlọ nke May 31st metụtara ụlọ mmepụta akụrụngwa ụgbọala ya makana o mere ka ha kwụsị igwe ha na-emepụta akụrụ ngwa ụgbọala n'ike nke mefuru ha ọtụtụ ego. Chukwuma kwuru na ọ ga-adịmma ka ndị Igbo niile nọkọta ọnụ kpaa akpa ka ewepụta otu ụbọchị n'ime afọ ọbụla iji na-edowe iwu nnọrọ n'ụlọ maka ncheta Biafra. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ipob 'sit at home'" afirika-49080546,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49080546,Precious Owolabi: Ọgụ shịịte ataala isi onye ntaakụkọ Channels,"Nwa okorobia na-efe ala nna ya n'ụlọọrụ mgbasaozi ""Channels"" anwụọla n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị uweojii na ndị Shiite.",Precious nwụrụ mgbe mgbọ egbe a na-agba tụrụ ya oge ọ na-esete ọgụ ahụ na Abuja. Ụlọọrụ Channels egosipụtala obi mgbawa ha gbasara ya bụ ọnwụ onye ntaakụkọ ha chere ga-eme ọfụma n'ọdịnihu. Ha na-arịọ ka Chukwu nara mkpuru obi ya na ndokwa. Mana ụmụ Naịjirịa nọ n'elu soshal midia ne-ekwu uche ha kamgbe ọ nwụchara. @EmmanuelNgwaogu gosiri nwute ya. @MoghaluKingsley kwuru na onyeisiala Buhari kwesiri ka iwe otu dị iche iche na Naịjirịa na-eme ngagharị iwe dajụọ. @thestatewriter kwuru na ọ maghị iher mere ndị ọchịchị Naịjirịa jiri gbachị nkịtị a na-akwafu ọbara ụmụ Naịjirịa na-eme ọfụma. @cchukudebelu kwuru na ndụ ụmụ Naịjirịa adịghị ndị nọ n'ọchịchị mkpa. afirika-47131471,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47131471,Referendum: Ndị agha Naijiria na-agba egbe ọnụ- Ipob,Otu Indigenouus People of Biafra nke a kpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuola na ndịagha Naijiria ịmaja ndị otu ha bụ ụzọ ha si achọ ịwakpo ma gbuo Ndigbo ọzọ na ntuliaka.,"Ụbọchị Monde, onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere iwu ka echechie ndị Ipob dịka a na-akwado ntuliaka site ihiwe atụmatụ a kpọrọ ""Operation Safe Conduct"" na Bekee. Mana otu Ipob kwuru na ọ bụ egbeọnụ ka ha na-agba n'ihi na ha bụ Ipob anaghị akwado ọgụ egbe na mma. Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Chukwudi Peace nwere n'ekwentị, o kwuru na naanị ma ndịagha Naijiria agara n'ụlọ n'ụlọ ga na-anwụchi ndị mmadụ, na o nweghị ihe ha nwere ike imenwu ha. N'okwu ya, ọ sịrị ""Ha na-adị njikere ịlụso Ipob ọgụ, Ipob eji egbe ka ọ bụ mma?"" Ọ bụrụ na Ipob na-ekwu na anyị ga-ebu egbe pụta chere ndị na-atụ vootu, ịghọta ya n'ụdị a ha na-akọ."" ""Naanị ma ha aga n'ụlọ n'ụlọ na-akpụpụta ndị mmadụ na-agbagbu. Ọ bụ egbeọnụ ka ha na-agba."" Ipob: Ndị agha Naijiria na-agba egbe ọnụ Ọ kọwara na referandum ha na-akwado ụbọchị Februwarị 16 bụ Ndigbo ịnọrọ n'ụlọ ghara ịpụta mee ntuliaka. ""Ipob kọwara ndị be anyị na o nweghị uru ọ bara ị puta kwụrụ n'anwụ maka ntuliaka."" ""UN kwuru na ịchọ inwere onwe gị ị gaghị na-esonye na ntuliaka obodo ị chọrọ isi na ya pụọ maọbụ na ị pụrụ n'ilo tụnye akwụkwọ sị lee ihe ị chọrọ."" Ọ kọwara na referedum bụ ihe ị ga-eme iji gọsị ihe ọtụtụ mmadụ chọrọ nke e nwere ike igosi site n'ịnọ n'ụlọ. ""Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ anọrọ n'ụlọ, ihe o gosiri bụ na referandum anyị agala ọfụma."" Peace boro ndịagha na ha na-atụ atụmatụ ịgbagbu ndị mmadụ kwụ n'ahịrị maka ntuliaka, bo ya ndị Ipob. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51364672,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51364672,Urine Cup: Iko ga-eme ka nwaanyị nyụọ mamịrị ka nwoke,Otu nwaanyị Kenya na-eweta usoro e nwereike iji gbochie nsogbu ibute ọrịa site n'ụlọmposi ọha nke na-adịghị ọcha.,"Ndị dọkịnta sị na iko a na-ebelata ibute nje n'ụlọmposi Njeri Muthaka na-ere iko mamịrị nke na-enyere ụmụnwaanyị aka ịkwụ ọtọ nyụọ mamịrị ka ha ghara ịnọ ọdụ n'ụlọmposi bute ọrịa. Muthaka gwara BBC na o bubatara iko mamịrị a mgbe ọ rịachara ọrịa si na mamịrị ọtụtụ oge. O ji ya nyụọ mamịrị ma chọpụta na o nyere aka belata etu o si ebute ọrịa a, nke mere o ji malite ire iko a. Ndị dọkịnta kwetere sị na iko mamịrị a na-enye aka ibelata ibute ọrịa. ""Ọ bụrụ na ị naghị etukwu ala anyụ mamịrị, ị gaghị eru ụlọmposi nso nke pụtara na ị gaghị eji ike ebute ọrịa. Ị ga-egbochi ibute ọtụtụ nje dị iche iche,"" dịka dọkịnta Chris si kwuo. Mana ụmụnwoke ndị Kenya sị na iko a megidere omenala ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49452315,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49452315,Anne Njemanze sị na ọ ga-amasị ya ịlụ di nke ugboro atọ ma mụọ nwa ọzọ,Nwaada Anne Njemanze bụ onye na-eme ejije na Nollywood ekwuola na ọ dị njikere ịnabata nwoke ọzọ na ndụ ya dịka di.,"Anne Njemanze so mee ihe nkiri a kpọrọ ""Domitila"" Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, 23 Ọgọst, afọ 2019, Anne kọwara etu ije alụmdinanwunye ya si gaa. Content is not available End of Facebook post, 1 O kwuru na o ji anya ụmụaka lụọ di mbụ ọ lụrụ bụ Segun Arinze, nke ha mechara gbasaa mgbe ha mụtara otu nwa nwaanyị. Anne bụ onye e ji aha 'Domitila' mara kwuru na agbanyeghi na ọ mụọla ụmụ abụọ, na ọ dị njikere ịlụ di ma ọ hụ nwoke dị mma. Anne na onye ntaakụkọ BBC Igbo mere mkparịtaụka ebe o kwuru ihe dị ya n'obi ma gbakwaa egwu ukwu ndị Owere O kwuru na obi ga-adị ya mma nke ukwuu ma ọ bụrụ na ọ mụọ ụmụejima tinyere abụọ ndị ọ mụrụla amụ. Anne gara n'ihu dọọ ndị na-achọ alụmdinanwunye aka na ntị ka ha saa anya ha mmiri n'ịhọrọ onye ha ga-alụ. Anne malitere ime ejije n'ime ihe karịrị afọ 20 gara aga, ebe o mere ihe onyonyo dịka 'Rattle Snake', 'Domitila' dgz. N'ime di abụọ ọ lụrụla, Anne mụtara ụmụaka abụọ; otu nwoke na otu nwaanyị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile" afirika-44276867,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44276867,Ipob na ndị uweojii amaala aka maka Mee 30,Ndị uweojii Anambra steeti na ndị Ipob na-asọ mpi maka 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' ndị otu Ipob chọrọ ime n'ụbọchị Mee 30.,"Ndị Ipob Ka ndị uweojii na-ekwusiike na Ipob bụ otu amachịrị amachị, nke mere na onweịghị ike ịgwa ndị mmadu pụta bịa mee ngagharị iwe, ndị Ipob na-ekwu na ndị uweojii enweghị ike ịkwụsị ncheta ya chọrọ ime maka ndị nwụrụ maka ihi Biafra. Onye na-ekwụchịtere ndi uweojii na Anambara steeti bụ Garba Umar kọwara Ipob ka otu ndị ntoroọbịa amachaghị ihe ha na-eme, ma gwa ndị mmadụ ka ha gba ha nkịtị na-aga ọru ha. Garba Umar kwukwara na ndị uweojii n'Anambara dị njikere maka ihe ọbụla ga-eme. ""Ndị uweojii na ndị nchekwa ọzọ agaghi egbụ oge ị hụ na-emesiri onye ọbụla butere ọgbaaghara ike. Mana, ndị Ipob, site na ozi Emma Powerful zịpụrụ, kwuru na onweghi ihe ga-egbochi ihe ha na-akwado ime na ụbọchị 30 Mee ha kwuru na ndị mmadụ ga-anọdụ n'ụlọ, ma kwuo na a ga-eme ha bụ ihe na mba 100 ndi ọzọ. Ka nke a na-eme, ndị mmadụ na Twitter na ekwukwa na eche bu ụbọchị 29 Mee, bu ụbọchi gọọmentị Naịjirịa kewapụtara ka oge eji echeta ọchịchị onye kwuo uche ya, bụ oge ha ga echeta ndị Naịjirịa nwụrụ n'ogbugbu mmadụ na Naịjirịa. Ha na agbasa ozi na atụmatụ ha kpọrọ #NationalDayOfMourning. IPOB gakwara n'ihu kwuo na ihe a ha chọrọ ime gbasara nkwanye ndị egbụrụ n'agha Biafra ugwu. Ha kagbụkwara ihe ha kpọrọ itinye ọnụ uweojii tinyere n'ihe agbasara ha. Ha kwukwara na ndi uweojii enweghị ikike itinye ọnụ na ihe banyere ofufe mmadụ makana ọ bụ ikike onye ọbụla nwere. ""Ndị Biafra, ebe ọbụla ha nọ, kwesịrị ịkwanyere ndị nwụru n'agha Biafra ugwu. Ndị mmadu nọ naala Igbo, mba mmiri, na ebe ọzọ kwesịrị ị nọ n'ime ụlọ site elekere isii nke ehihe n'ụbọchị 29 Mee ruo elekere isii nke Wenesde May 30,""Ipob kwuru. Ndị akpọrọ Eastern Consultative Assembly (ECA) ekwuola na ha kwadoro ihe a ndị Ipob chọrọ ime. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43257520,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43257520,Boko Haram e gbuola mmadụ ato na ọkara Cameroon,Akụkọ si na ụgwụ hausa dị na Naijịria na-ekwu na ndị ọrụ enyemaka atọ na ndị gbara ọsọ ndụ na ọkara Cameroon akpọrọ Rann.,"Ndị ọrụ UN na-ebupu ozu ndị ọrụ enyemaka meruru ahụ na mwakpo a Ha nwuru maka mwakpo ndị Boko haram. Ndi Boko haram gbukwara ndị nche atọ ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ. Onye ntakụkọ BBC akporọ Chris Ewokor kwuru na ndị mwakpo a ji ụgbọala na ọgba tum tum wee wakpo ụlọ ndị agha Naijiria dị n'ọkara Naijirịa na Cameroon. Ọ sị na ọ bụ onye ọrụ UN akpọrọ Edward Kallon kwuputere nke a . Ndị agha Naijịria turu ogbunigwe n'ụlọ ndị gbara ọsọ ndụ na Rann na arọ 2017 O nwebeghi ihe ndi agha Naijiria kwugoro gbasara ihe mwakpo a mana akukọ na-ekwu na egburu ndị nchekwa ato na-elekota ụlọ ndị gbara ọsọ ndụ. Amaghị mmadụ ole n'ime gbara ọsọ ndụ ihe a metutara. Rann bụ obele obodo dị na Naijiria dị n'ọkara Cameroon ebe ndị Na ọnwa Janụarị 2017,ụgboelu ndi Niaijiria turu ogbunigwe gburu mmadụ nari otu,iri na ise n'ụlọ ndị a gbara ọsọ agha maka na ha che na ọ bụ ụlọ ndị Boko haram. Ndị Boko haram a malitela n'ike na nso nso a, nagbanyeghi na ndi agha Naijiria na e merie la ha." egwuregwu-49392541,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49392541,Wolves vs Man United: Di na nwunye a ekpeela udo n’alụmdinanwunye ha,Mbọ niile otu Manchester United gbara ịhụ na ha gbara Wolverhampton alụkwaghịm biri na 'onye lawa onye lawa'.,"Man Utd bu ụzọ jaa eze dịka Anthony Martial dọriri neetị na nkeji 27. Mana Ruben Neves nke Wolves sị ha ""taa kpuchie ọnụ"" ka ọ sara goolu ha na nkeji 55. Goolu ahụ bu ọbara mgbalielu nke ya bịa dịka ogbuopi kwụsịrị bọọlụ ka e were ihe onyonyo Video assistant referee (VAR) nyochaa ma ọ gara ọfụma. Man Utd nwetara ohere ifere di ha aka na nkeji 67 oge ha nwetara penariti ka Conor Coady gbaturu ya. Mana Paul Pogba riwara ha obi ka Rui Patricio kwapụrụ bọọlụ. Nke a mere ya penariti nke anọ Paul Pogba na-eri na Premier League kemgbe afọ bọọlụ gara aga malitere Raul Jimenez so ""kwụọ ụgwọisi"" Man Utd n'afọ gara aga, nwakwara ike ya ọkachasị n'ọkara nke abụọ, mana isi ya apụtaghị. Mbọ niile Man Utd gbara iji gbapụta onwe ha ma zaa aha nna ha enweghi isi, n'agbanyeghi na ha gbara ọfụma n'ụzọ gaara enwetara ha mmeri. N'otu aka ahụ, nwebata Wolves webatara Adama Traore n'ọkara nke abụọ nyerela ha aka ime ka egwu dagharịa, nke butere goolu ha mechara nye. Man Utd ga-ezute Crystal Palace ụbọchị satọde bụ 24 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe Wolves ga-ezute Burnley ụbọchị Sọnde bụ 25. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-47392132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47392132,Dangote: Ego Dangote arịala elu ọzọ,Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ego niile Dangote nwere jiri ihe karịrị ijeri dọlla ise rịa elu n'ime sọsọ otu ụbọchị.,"Nke a mere ka ọkwa ya na ndị kachasị bụrụ ọgaranya n'ụwa niile rigo na iri ise n'anọ. Dangote ka bụ nwoke kachasị bụrụ ọgaranya na mba Afrịka. Onyeisiala 2023 na nsonso a? Rotimi Amaechi bụ onye chiburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka 2019, ụmụ Naijiria ebidola ị ma atụ gbasara ndị ha chọrọ ka ha zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Ọtụtụ na ọkammuta Yemi Osinbajo na Nuhu Ribadu dịka osote ya maọbụ , Rotimi Amaechi nakwa Babatunde Fashola. Na mba ofesi, Ikuku kuru na Naịjirịa ekuola na mba Senegal dịka onyeisiala ha bụ Macky Sall meriri ntuliaka iji nọrọ n'ọkwa ya n'agba nke abụọ. Cheta na ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị ka mba Senegal mere ntuliaka ọkwa onyeisiala nke ha. N'egwuregwu, Ụlọ na-arụpụta uwe egwuregwu bụ PUMA anarala ogbo ha bụ NIKE ọrụ ịbiputara otu Manchester uwe egwuregwu N'akwụkwọ PUMA na Man City binyere aka, njịkọ ha ga-ewe nde pounds narị isii na iri ise ma rue afọ iri. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụtụtụ Olisa Agbakoba bụ onye ọkaiwu ukwu na Naịjirịa akpọkuola Atiku Abubakar ka ọ nabata mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala. N'akwụkwọ Agbakoba zisara na Legọs, o kwuru na etu e si mee ntuliaka nke afọ a na mpụtara ya gosiri na ihe gbasara agbụrụ bịara ""bọodụ"". O kwuru na APC na PDP ritere uru si n'etu e si tụọ ya bụ vootu. Ọ gara n'ihu kwuo ka Atiku ghara ịga ụlọikpe nke ntuliaka makana ọ bụghị ihe kwesịrị ka o mee. Briten kwadoro ntuliaka Buhari Minista na-ahụ maka ihe banyere mpaghara Afrịka na mba Brịten bụ Harriet Baldwine kelela Onyeisiala Buhari maka mmeri o nwetara na ntuliaka e mere na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde gara aga. Baldwin kwuru na ọnụọgụgụ Inec wepụtara na ọ bụ ihe e nwetere na ya bụ ntuliaka, bụ nke dịka nke e nwetere n'atụmatụ Bekee kpọrọ ""Parrallel Vote Tabulation"", wee na-asị ndị Naịjirịa nabata mpụtara a. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Election Result 2019: Mba Briten sị na mmeri Buhari kwụ ọtọ YIAGA tinyekwara ọnụ Nke a na-abịakwa ka otu na-ahụ maka oke ruru onye a na-akpọ ""Youth Initiative for Advocacy, Growth and Advancement YIAGA AFRICA"" kwuru na mpụtara ntuliaka a dị etu o kwesịrị ịdị, na ọ bụrụ adịgboroja. Ha dekwara sị na mpụtara ntuliaka a dabara n'ogo ha nyochapụtara na o kwesịrị: Ihe Mbaka kwuru maka mmeri Buhari Onye ụkọchukwu ama ama bụ Rev. Fr. Ejike Mbaka ekwuola na ya ga-eji izu ụka a niile na-eto chukwu ma na-enwe aṅụrị maka mmeri Buhari meriri Atiku. Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" Mbaka kwuru na ọ bụ maka mkparị Peter Obi na ndị otu ya kparịrị ya ka o jiri daa ya bụ ntuliaka. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: Fr Mbaka na-enwe nnukwu aṅụrị n'ihi na Buhari emeriela N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, na nke mba Nọt Korea bụ Kim Jung-Un, abanyela ụbọchị abụọ bụ ụbọchị ikpeazụ ha ga-ama ebe ha kwụ akwụ gbasara ihe bekee kpọrọ ""denuclearisation"". Ka nzukọ a mechara n'ụtụtụ Febrụwarị 28, 2019, mmadụ abụọ a erughi na nkwekọrịta. Trump kwuru na ""Anyị ekweghi ahọrọ asịsa ọbụla ha họpụtara"" ma kwuo ""Ọ gaara adị njọ ibinye aka nkewkọrịta n'ihe ọbụla"". Mike Pompeo bụ odeakwụkwọ kachasị nke mba Amerịka, kwuru na mba abụọ ahụ kwekọrịtara na ha ga na-agbalị ịhụ na isi pụtara n'isiokwu a. N'ikpeazụ, Nọt Koria kwuru na ha chọrọ ka mba Amerịka wepụ iwu ha ji machibido ha, na ọ bụrụ na ha mee nke a, na ha bụ Nọt Koria ga-akụkasị ebe a na-arụpụta ngwaagha nuklia dị na Yongbyon, mana Amerịka ekwenyeghi. Mana Trump kwuru na Jong-Un kwere ya nkwa na ọ ga-akwụsị ịnwale ngwaagha nuklia maọbụ mịsaịl nke na-agate aka. N'egwuregwu, Arsenal, Chelsea, Man United, Liverpool na Man City merichara ndị ọ bụ ha na ha na Premier League a gbara n'Abalị. Arsenal na Liverpool nyechara goolu ise ise, Chelsea nyere goolu abụọ, Man Utd nyere atọ ebe Man City nyere naanị otu goolu iji merie. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri BBC Igbo: Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere" afirika-45293685,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45293685,#Freeowerri112: Ihe ji bupu ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob-Ndị ọrụ mkpọrọ,Madugba James bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ mkpọrọ n'Imo Steeti akọwala ihe mere eji bupu ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob gawa n'ụlọ mkpọrọ dị n'Okigwe.,"Ọ gwara BBC Igbo na ""ọ bụ maka ha karịrị otu narị bụ nke ụlọ mkpọrọ dị n'Owere enweghi ngwa zuru oke eji elekọta ha nille."" ""Nke a mere eji buru mmadụ iri n'ime ha gawa ụlọ mkpọrọ dị n'Okigwe ebe a ga-elekọta ha anya dịka ụmụnwaanyị."" Madugba gara n'ihu kwuo na ha ga-enyocha ụmụnwaanyị ndị a ahụ iji chọpụta ndị bu afọime ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ. O kwuru na ọ bụ iji gbochie ebubo na-ekwu na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-atụrụ ime n'ime ụlọ mkpọrọ. Cheta na ndị uweojii Imo steeti nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a karịrị otu narị n'izuụka gara aga ebe ha na-eme ngagharịiwe n'owere. Akpọpụrụ ha n'ụlọikpe ebe ọkaikpe S.K. Durumba kwuru ka akpọchie ha n'ụlọ mkpọrọ rue ọnwa Seputemba. Ụmụnwaanyị Ipob: Buhari na-achọ nnukwu okwu Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49656711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49656711,Ụgwọ akwụkwo Sepụtemba a na-anyịji gị aka?,Ọnwa sepụtemba bụ ọnwa a ma ama n'ụwa niile mgbe ụmu akwụkwọ ji alaghachi akwụkwọ.,"Nke a mere na ụfọdụ nne na nna na-echekasị onwe ha tupu ọnwa e ruo iji hụ na ha kwụrụ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ha. BBC Igbo jụtara otu onye ọkachamara na ndekọ ego bụ Tosin Olaseinde etu ha ga-esi gbalahụ nsogbu a. Lee ihe ndị ọ kọwara Kwado ọfụma na mbido afọ ọbụla Olaseinde kọwara na ọ ga-adị mfe ma ọ bụru onye ọbụla na-akwụ ụgwọ akwụkwọ gụkọọ ole ọ ga-apụta n'otu afọ ma malite ịdokọ ego kwa ọnwa maka ya. Nke a ga-eme na mgbe ọnwa Sepụtemba ruru onye ahụ ga-enwe ike lekọta ihe gbasara ịlọghachi akwụkwọ ụmụ ya. Bite ego Ụlọakwaụkwọ nke gọọmentị Ihe ọzọ Olaseninde gwara ndị nne na nna bụ na ha nwereike ịbite ego. O nwere ụfọdụ ụlọọrụ, ọrụ ha bụ ịnyere ndị nne na nna kwụọ ụgwọ akwụkwọ nke ha ga-akwụghachi n'ọdịnịhu. Nke a ga-ebute obi iru ala ma abanye n'ọwa sepụtemba. Nweta ọrụ aka pụrụiche ga na-akwụ ya bụ ụgwọ Ihe ịkpeazụ onye ọkachamara gwara BBC Igbo bụ ụzọ ọzọ dị ndị na-akwụ ụgwọ akwụkwọ ga-esi nwe ezunmike na sepụtemba. ""Ha nwereike ịchọ ọrụ aka ọzọ tinye aka nke mkpụrụ si na ya ga-abụ maka ụgwọ akwụkwọ ụmụ ha"" O kwuru nke a maka ndị ụgwọ ọnwa anaghị ezu iji lekọta ụgwọ akwụkwọ na ihe ndị ọzọ. Olaseinde kwuru ka ndị nne na nna ghara ịda mba maka ụgwọ akwụkwọ kwa mgbe kwa mgbe. ""Agụmakwụkwọ zuru oke bụ ahịa ọma na-ere onwe ya"" dịka ọ kọwara. Ihe nkiri ga-amasị gị Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis" afirika-53458111,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53458111,Akụkọ odogwu nwoke mbụ nabatara ndị ọcha ma webata mmepe n'Enugwu,Igbo tụrụ ilu sị na a na-enwe obodo enwe maka na obodo anaghị eko n'elu ka ụgbọgụrụ.,"A kọwa akụkọ ndị nwe obodo Enugwu n'oge gboo, onye mbụ a ga-akpọ aha bụ Mazị Onyeama n'Eke. Ọ bụ ya bụ nwoke mbụ kara obi gakwuru ndị ọcha oge mbụ ha batara na mpaghara Enugwu. Nke a mere ka ya na ha dị na mma, o wee sizie n'aka ndị ọcha webata ọtụtụ ihe mere ka Enugwu mepee. Ụfọdụ na-ekwukwa na Onyeama n'Eke bụ nwaafọ Igbo mbụ gara mba ofesi n'abụghị dịka ohu. Gere akụkọ ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu. Onye mere akụkọ a bụChris OkerekenaChiemela Peter. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-50038693,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038693,Onye omeiwu apụtala ụlọikpe maka ịgbọ ncha na Tunisia,Igbọ ncha edubanyela otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọnwụnwa na mba Tunisia.,"A kpụpụrụ Zouheir Makhlouf, bụ onye ụlọomeiwu na mba ahụ e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-agbọ ncha n'ihu ụlọakwụkwọ, ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya. Makhlouf bụ onye pati Qalb Tounes, gọrọ agọ sị na ọ bụ naanị mamịrị ka ọ na-anyụnye na karama maka ọrịa shuga ọ na-arịa. Ihe onyonyo ahụ e kesara ọfụma na soshal midia mba ha mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ malite ikwu maka etu ụmụnwoke si enye ha nsogbu maka nsori, nke ha kpọrọ #EnaZeda. #EnaZeda pụtara ""ma mụnwa"" n'asụsụ ndị Tunisia. I nwere kaadị njirimara (National ID card)? Ọ bụrụ na oge kaadị njirimara nke Naịjirịa gị agafeela, mara na ị ga-ejide puku naịra atọ ị ga-eji gbata ọzọ ugbua, dịka ngalaba ""National Identity Management Commission (NIMC)"" na-ahụ maka ya si kwuo. Ọ bụrụkwanụ na o fuola, mara na ọ ga-eri gị puku naịra ise iji nweta ọzọ. Mana ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ ""ebe ọ bụ na a kwụghị ụgwọ gbata ya na mbụ, maka gịnị ka a ga-eji malite ịkwụ ụgwọ maka inweta ọzọ?"" Oge ọgwụgwụ oge oruola? Ụlọ ebe nwoke na ụmụ ya isii bi na-eche ọgwụgwụ oge, ndị uweojii sị na nke a gbara ha gharịị Ezinaụlọ zoro ezo na-eche mgbe ụwa ga-emebi apụtala ka afọ itoolu gafere. Ndị uweojii mechara chọta nwoke dị afọ iri ise na asatọ nakwa ụmụntorobịa ruru isii gara kwaba n'ime okpuru ụlọ biri na-eche ọgwụgwụ oge n'obodo Drenthe dị na mba Netherlands, ka otu n'ime ha pụtara ịbịa zụrụ mmanya biya. Ọnọdụ Uzoho Ka ọ dị ugbua, amabeghi mgbe aka na-aghọrọ ndị Super Eagles mgbọ bụ Francis Uzoho ga-ahụ ihu poostu anya ọzọ. Cheta na e bupuru ya n'ọgbọ egwuregwu oge Naịjirịa na Brazịl zutere ụbọchị ụka, ka ọ merụchara ahụ. Anyị na Buhari ga-edọrịta ụka - Ndị ndu ala Igbo Ndị gọvanọ nakwa ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ ekpebiela ị gazute onysisiala Buharị n'ụbọchị Tọzde n'ihi ọkwụ banyere ọ dị mma Ndigbo. Mkpebi ha na-abịa dịka ha nwekwara nzuko n'Enugwu ụnyaahụ. Onyeisioche ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti gwara ndị ntaakụkọ nke a. Ndị so na nzuko a gụnyere gọvanọ Enugwu Ifeanyi Ugwuanyi, nke Abia bụ Okezie Ikpeazụ, osote gọvanọ Imo bụ Gerald Irona. Ndị ọzọ gụnyere Enyinnaya Abaribe, Victor Umeh, Nnia Nwodo, nakwa ndị isi ụka katọlik na Metọdis bụ Callistus Onaga na Christopher Ede. Uweojii achọpụtala ụlọ ntaramahụhụ ọzọ Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Ndị uweojii Katsina Steeti achọpụta ụlọ okpukperechị ọzọ ebe ekere ọtụtụ ụmụaka agbụ ma na-ata ahụhụ n'ụzọ dị iche iche na Sabon Garin dị na steeti ahụ. Kọmishọna ndị uweojii bụ Sanusi Buba sị na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Bello Abdullahi Umar nwe ụlọ a nakwa ndị nọ ebe ahụ dị ogogo afọ asaa ruo afọ iri anọ. N'ofesi Mba Amerịka eyiela ndị mịnịsta Mba Turkey abụọ na ndị ọrụ ha egwu ịmachi ha n'ihi mwakpo ndị agha ha wakporo mpaghara ugwu Syria. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ ogbo ya nke Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan n'ekwentị sị ya ka ọgba mbọ mee udo. N'egwuregwu Aha nwafọ mba Pọtugal na-agba bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na-ada ụda maka goolu nke narị asaa ya o nyere ụnyaahụ n'asọmpi ha ndị Ukren gbara ụnyaahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 52953379,https://www.bbc.com/igbo/52953379,Biafra Separatists: Ebubo Gọọmenti etiti boro Ipob bụ ebubo ụgha - Ikokwu,"Guy Ikokwu bụ otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ekwuola na ebubo gọọmentị Naịjirịa boro otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ""okwu ụgha.""","Nke a na-abịa dịka gọomentị boro Ipob ebubo igobi ndị ọcha ka ha were akụkọ ụgha na-etisa mmekọrịta dị n'etiti Naijiria na mba Briten, Amerika na ndị ọzọ. Ụlọọrụ onyeisiala boburu ebubo na nnyocha ha mere gosiri na Ipob ji mbombo ego na-agbasa ozi ụgha nke kwuru na a na-akpagbu ndị otu Kraisti na Naijiria nke ha ji etisa ezigbo mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti Naịjirịa, mba Amerịka, UK nakwa Yurop. Mana Ikokwu, onye bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchi n'oge agba nke abụọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria (Second Republic) kwuru na ebubo ahụ bụ okpotokpo asị. ""Ihe ha na-ebo Ipob sị na Ipob were nde dọla iri asatọ na ise (85 million dollar) nye ndị ọcha bụ oke asị. Ihe a bụ ka ha were tinye aghara na be anyị. Ka ndị mmadụ were jụwazie Ipob e nwere ụdị ego a?"" Guy Ikokwu bụ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'oge agba nke abụọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria (Second Republic) O boro ebubo na gọọmenti gbara nkiti ndị na-eyi ndụ egwu na ndị ochiehi na-egbusi mmadu, na-emebi ihe ndị mmadụ kọrọ ọkachasị ndị otu Kraist kọrọ na enweghị ntaramahụhụ ọbụla. Ikokwu onye bụ onye ndọrọndọrọ welitara isi n'ọchịchị oge ndị agbada agba nke abụọ na Naijiria (second republic) dọọ ndị Igbo aka na ntị ka ha mụrụ anya dịka azụ n'ihi na ""Onye ndị iro gbara gburugburu na-eche ndụ ya nche mgbe niile."" ""Ha ji ọkwa, jide ihe e ji alụ ọgụ na ihe niile e ji achị ọchịchị,"" na-akpọbata ndị be si mba ndị ọzọ na Naijiria iji weghara naijiria. eme ihe masiri ha ma gba nkikiti ka ndị ụka alakuba na-emekpa ndị otu Kraisti ahụ. O kwuru na mkpu Ipob na-eti bụ ka ụwa nụrụ olu ha banyere mmegbu ndị Igbo na-agabiga na Naijiria. Ikokwu kọwara na ndị Igbo anaghị achọ okwu ebe ọbụla ha gara kama ọ bụ ọganihu na ndozi obodo. Gee ihe guy Ikokwu kwuru n'uju ebe a: 'Ebubo Gọọmenti etiti boro Ipob bụ ebubo ugha' Ihe 10 Garba Shehu boro Ipob ọhụrụ a Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjiria bụ Garba Shehu ekwuola ka otu Indigenous People of Biafra(Ipob) si eji ebubo gbasara imegide ndị ụka Kraist akatọ mba Naịjiria. O kwuru na ụlọọrụ onyeisiala sị n'aka ngalaba na-emere gọọmenti nyocha chọpụta na Ipob na-agbasa ozi ụgha gbara ụzọ abụọ n'otu mgbe gbasara mmegide a. O kwuru na ozi ụgha abụọ ahụ ji mkpụchị ụka Kraist na-akpọkụ ndị isi mba Amerịka ka ha kwụsị oke ogbugbu ndị ụka Kraist mana ha ma na ọ bụ iji tisa ezigbo mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti Naịjirịa, mba US, UK nakwa Yurop. Lee ihe ndị ọzọ o depụtara ebe a. O kwuru na ngalaba ndị dị n'ofesi nwereike ị bia Naịjirịa bịa hụ asị otu Ipob na-atụ ka wee were aghụgho nata ha ego ma tinye ha n'ajọ omume nke ha ji etigharị ha naya ka ha wee mebie mmekọrịta ndị mba ofesi na Naịjirịa. Lee ihe Nnamdi Kanu sara ya Onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ugbua ụwa niile amarala ebe ego ndị otu ya na-atụkọta na-aga. Ọ gara n'ihu rụtụ aka n'ozi si n'akwukwọ otu ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu. Kanu kwuru na Shehu depụtara na Ipob na-ebogide Naịjirịa ebubo ụgha gbasara mmegide ndị ụka Kraist nke eji ego ruru puku dọla iri asatọ na ise akwado kamgbe ọnwa Ọktoba n'ime afọ 2019. Nke a mere ka Nnamdi Kanu kwuo na ya enweghị ụgbọala, ụlọ oriri na nkwari maọbụ mahadum, wdgz mana o nwere amara Chukwu Okike Abiama. O kwukwara na ya ji ego niile ndị otu Ipob na-atụkọta agba mbọ nnwereonwe ha nakwa ịgbajọ Naịjirịa. N'ọkwu ya, Naijịrịa ekwetala na Ipob na-emefu ego n'ihe gbasara mmekọrịta ndị otu Ipob na ndị mba ofesi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52449650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52449650,"Autism, sickle cell na ọrịa ndị ọzọ ndị Naịjirịa na-aghọtaghie ma jiri akpaso ndị na-arịa ya oke","N'oge mbu, ha dị ọtụtụ ọrịa nke ndị Igbo na-aghọtachaghị nke ọma nke mere na ha anaghị elebara onye nwere ụdị ọria ndị a anya nke ọma.","Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-akwa ndị nwere 'autism' emu ma na-akpọ ha 'imbecile', nke a jọgburu onwe ya Oge ụfọdụ ndị mmadụ na-emekpa ndị na-arịa orịa ndị a ahu, dịka a ga-asị na ọ bụ ha mere onwe ha ihe ha na-arịa. Mana ugbua, dịka nnyocha ahụike na-abawanye, o doola anya na ihe ndị nnanna anyi ha chere gbasara ụfọdụ ọria abụghị ya n'eziokwu. Lee ụfọdụ ọrịa ndi ahu nakwa etu e kwesịrị isi meso onye nwere ya omume: Sickle Cell Anaemia (Ogbanje) Arts: 'Ihe osise ka m ji akọ akụkọ ọbụla m chọrọ ikọ' Kelechi Amadi-obi N'oge gboo, ọ bụrụ na nwa mmadụ nwụọ ugboro ugboro, ndi mmadu ga asi na nwa ahụ bụ ọgbanje. A ga-asị na nwa ahụ si n'ala mmụọ abịa emekpa ndị mụrụ ya ahụ. Nwa di otu a nwụọ, a na-eji mma dị nkọ kawachaa ya ahụ, maọbụ pịa ozu ya ụtarị nke oma, buru n'uche na nke ahu ga-egbochi ya ịlọghachi ọzọ. Mana ihe ndị a abụchaghị eziokwu. Sickle Cell Eradication Law: Ọ ga-ebute ịkpa oke megide ndị na-arịa ọrịa ọwọ - Ọkaiwu Eze Nnyocha egosila na nwa dị otu a nwere ike inwe ọrịa 'sickle cell' nke bụ ọrịa ọbara ọ natara site n'aka nne na nna ya. Ihe na-akpata 'sickle cell' bụ mgbe nne na nna nwere ụdị obara 'AS', nwa ha nwere ike bụrụ 'SS'. Ụdị nwa dị otu a kwesiri ka a kpachapụrụ ya anya nke ọma, maka na nnyocha gosiri na o nwere mgbe ọ ga-etoruo, o toffee ya bụ ọrịa. Ndị mmadụ kwesịkwara ịga nnyocha tupu ha alụọ onwe ha iji mata ma ọbara ha abụọ ọ ga-agakọ. Dyslexia Ndị nwere 'dyslexia' na-aka eji ihe eserese amụta ihe karịa ihe ederede Nke a bụ ọrịa ụbụrụ nke nwere ike ime ka nwata ghara i na-amụta akwukwo dika ibe ya si amụta. Ọ bụrụ na nne na nna akpachapụghị anya, ha agaghị ama na nwa ha nwere 'dyslexia', ha ga na-asị na nwata ahụ bụ iti bọrịbọ. Mana nchọpụta gosiri na ndị nwere 'dyslexia' na-aka eji ihe eserese amụta ihe ngwangwa karịa ihe ederede. O dochabeghi anya ihe na-akpata ọrịa 'dyslexia' mana nnyocha egosila na umuaka nwere oria a na-enwekwa onyinye pụrụ iche. Ọ dịịrị nne na nna nwata dị otu a itinye anya na mmiri chọputa onyinye ahụ nwa ya nwere. Mental health Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka Mgbe ọbụla mmadụ kpawara agwa n'ụzọ dị aṅaa, ọtụtụ na-eche na onye ahụ apụọla ara. Ihe ọzọ bụ ịtụ onye ahụ ịga, maọbụ ịkpọrọ ya gawa ụlọ dibia maọbụ ụlọ ekpere. Mana nnyocha egosila na ọbụghị ọrịa isi niile bụ isi mgbaka. Ọtụtụ n'ime ha bụ ihe a ga-eji nke bekee kpọrọ 'psycho-therapy' gwọọ. World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma' 'Psycho-therapy' pụtara iji okwu ọnụ na ajụjụ dịgasị icheiche chọpụta ihe mmadụ na eche ma mara etu a ga-esi soo ya. Ha dị ọtụtụ ihe nwere ike ime ka isi gbaṅaa mmadu mana ọpụtaghị na onye ahụ agbapụla ara. Ihe ndị a gụnyere: Obi mmapu, obi ịda mba, nnukwu ihe mwute, dgz. Ihe e kwesiri ime bụ ịkpọga onye di otua ebe ndi ọkacha mara n'ọrịa isi ga-elebara ya anya. Autism Down Syndrome: Lee ihe mere eji amụ ụmụaka nwere nkwarụ 'down Syndrome' 'Autism' bụ ọrịa na-emetụta ụbụrụ ọkachasị mgbe mmadụ ka na-eto eto. O dochabeghi ndi ọkacha mara anya ihe na-akpata ya bụ ọrịa, mana nnyocha egosila na ụbụrụ ndị nwere 'autism' na nke ndị ọzọ anaghị abụcha otu ihe. Mana ọ dị mwute na ọtụtụ na-akpọ ndị nwere ọria 'imbecile' ma were ha na-eme ihe ọchị. Nke a jọgburu onwe ya. Ndi nwere 'autism' bụ mmadu zuru oke ma nwee uche zuru oke. Naanị ihe di iche bụ na etu ha si ahụta ihe dị iche n'etu ndi ọzọ si ahụta ya. Ọ bụrụ na a kpachapụrụ ha anya ma nye ha ọzụzụ kwesịrị ekwesị, ndi nwere 'autism' na-eme ihe gbara mmadu gharịị maka na ụbụrụ ha bu ọpụrụiche. Speech impairment Ụmụaka nwere ọnọdụ dị aṅaa kwesịrị ka a kpachapụrụ ha anya n'ụzọ pụrụ iche O nwere ọrịa nwere ike ime mmadụ anaghị ekwucha okwu ọfụma dịka ndị ọzọ. Ịsụ nsụ (stammering) nakwa nke bekee kpọrọ 'stuttering' bụcha ọnọdụ nwere ike imetụta etu mmadu si ekwu okwu. Mana oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-achị ndị dị otu a ọchị ma were ha na-eme ihe akaje. Oge ufodu kwa, a na-agwa onye na asụ nsụ ka o were ogele na-aṅu mmiri ka nsụ ya laa. Ihe ndị a abụghị etu o kwesiri ịdị. E nwere ndị ọkacha mara ga-elebara ndị nwere ụdị ọnọdụ a anya ma nye ha ọgwụgwọ zuru oke ka ha kawanye mma." afirika-55191483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55191483,"Tekno, Davido na Falz na aha ndị otiegwu ndị ọzọ nwere ike irite nzere 'Headie nke afọ 2020","Emume nturuugo ""Headie"" atụnyela n'ụkwụ, oge e ji ama mbe na abọ nke bụ oke n'ihe gbasara ndị tipụtara egwu na-amasị ọha.","Ndị aha ha pụtara na ha nwere ike ibu isi a la n'afọ gụnyere nwa afọ Tekno, Davido, Falz nakwa Simi. Lee ụfọdụ ndị aha ha dị na ndị nwere ike ibu isi ai ahụ laa n'afọ 2020: Nke kachasị amasị ndị na-ekiri (Headies' viewer's choice) Ndị a nwere ike irite ya nturuugo onye akachasị ele egwu ya: 1. Davido 2. Omah lay 3. Burna Boy 4. Falz 5. Fireboy DML 6. Mayorkun 7. Dj Neptune 8. Wizkid Ndị batara ahịa egwu ọhụrụ (Rookie of the year): Ndị a tipụtara egwu mbụ ha nwere ike irite ya: 1. Olakira 2. Alpha p 3. Jamopyper 4. Zinoleesky 5. Bad boy timz ""Best pop single"" Na ndị tipụtara egwu 'pop', lee ndị nwere ike irite nturuugo: 1. Billionaire - Teni 2. Nobody - Dj Neptune feat. Joeboy & Mr. eazi. 3. Lady - Rema 4. Fem - Davido 5. Joro - Wizkid 6. Skeletun - Tekno Egwu ọkakibe nke afọ a (Song of the year): Na ndị tipụtara egwu ọkachamma n'afọ, lee ndị nwere ike imeri: 1. Fem - Davido 2. Nobody - Dj Neptune feat. Joeboy & Mr. eazi 3. Joro - Wizkid 4. Mafo - Naira Marley 5. Duduke - Simi Ndị tipụtara egwu gbaliri (Next rated): A na-atụ anya na otu n'ime ndị a ga-emeri: 1. Tems 2. Omah lay 3. Oxlade 4. Bella Shmurda Otiegwu kachasị nke afọ a(Artiste of the year): Otu n'ime ndị a ga-ebu isi ahụ laa: 1. Burna boy 2. Davido 3. Wizkid 4. Mayorkun 5. Tiwa savage Nzere ""Songwriter of the year"" Ndị so na ndị nwere ike inweta nzere onye egwu o dere kachasị mma gụnyere: 1. Simisola Bolatito Ogunleye (Simi - duduke) 2. Adedamola Adefolahan (Fireboy DML - dreamer) 3. Damini Ogulu (Burna boy - way too big) 4. Stanley Omah Didia (Omah lay - bad influence) 5. Sadiq Onifade (Wurld - ghost town) 6. Adekunle Kosoko (1 milli) Aka ochie n'agụmegwu(Hall of fame): Nkwanyere ugwu pụrụ iche:" afirika-50215271,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50215271,Muhammadu Buhari: O mekarịala njem kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa May?,Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-esi mba Saudi Arebia ebe ọ gara maka nzukọ gbasara ọdịniihu achụmnta ego zọpụ ije garuo London ebe ọ ga-anọ njem ezumiike site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri na asaa.,"Njem a kpalitere okwu nke mere ka ụmụ Naijirịa jụwa maka ụgboro ole ọ nọrọla na mba ọzo na-abụghi Naijirịa. BBC mere nchịkọta ugboro ole na ole onyeisiala garala njem n'ofesi kamgbe ọ ṅụrụ iyiọrụ n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee 2019. Ebe ndị ọ gara na abalị ole ọ nọrọ Saudi Arebia Ọ gara Saudi Arebia ka chi ụbọchị e duru ya iyi ọrụ fochara, nke bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee. Niger Onyeisiala Muhammadu Buhari gara mba Nijee maka nzụko ""African Union"". Ọ hapụrụ Naijirịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị ma lọta n'ụbọchị asatọ. Ọ nọrọ otu abalị - Otu (1) Japan Onyeisiala Buhari gara mba Japan maka nzukọ ịkwalite akụnaụba mba ndị dị n'Afrịka. Ọ hapụrụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọstụ. Buhari lọtara n'ụbọchị iri atọ na otu nke Ọgọstụ. Ọ nọrọ abalị - Asaa (7) Burkina Faso Buhari hapụrụ Naịjiria gawa mba Bọkịna Faso n'ụbọchị iri na atọ nke Sepụtemba ma lọta n'ụbọchị iri na ise. Ọ nọrọ abalị - Atọ (3) New York Buhari hapụrụ Naịjirịa gawa mba Amerịka n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Sepụtemba maka nzụkọ 'United Nations General Assembly' (UNGA) na New York Ọ lọtara n'ụbọchi iri abụọ na asatọ. Ọ nọro abalị - Asaa (7) Saụt Afrịka Njem Buhari mere na mba Saụt Afrịka bidoro n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba ma lọta n'ụbọchị anọ nke Ọktoba. Buhari lọtara n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọktoba. Ọ nọrọ abalị - Atọ (3) Rọshịa Buhari gakwara mba Rọshịa n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba. Ọ lọtara n'ụbọchị iri abụọ na ise. Ọ nọrọ abalị - Ise (5) Abalị ole ka Onyeisiala Buhari nọrọla n'ofesi Onyeisiala Buhari anọola ihe ruru ụbọchị iri abụo na otu, nke pụtara izuụka atọ kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa Mee 2019. Akụkọ Ga-Amasị Gị Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-43597211,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43597211,Akụkọ kachasi taa: Okorocha na Arch. katọlik Owerri,"Gọvanọ Okorocha a maala Katọlik bishọp nke Owerri Diocese, bụ Anthony Obinna aka mgba.","Okorocha gwara Arch Bishop sị, ihe ọsọkwara ya mee na o nweghị ike ịtụkwasa onye patị APGA n'isi ndị Imo ka ọ chịa ha. Okorocha sịrị na Arch Bishọp siri onwe ị maja ya na ozi Easter ya. Okorocha na Arch. Bishọp Katọlik na-enwe ngbọtaghie Aka enwe n'ofe ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 Garba Shehu ojeozi onyeisiala na mgbasa ozi Adọla ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya maka ndị otu ọjọọ na-achọ ịkponye aja na garrị ntụliaka ọchịchị nke 2019. Garba Shehu bụ ojeozi mgbasa ozị onyeisiala gwara ndị isi ọrụ ntaakụkọ nke a ụnyaahụ mgbe ọ sị na enyopula aka enwe n'ofe ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019. Russia achụọla ndị nọchiteanya US iri isii na mbọrọ ọbọ Ọkọrọtọ mba US na Russia Mba Russia ekwuola na memmegwara anaghị ese okwu. Russia asịla mmadụ iri isii ndị nnọchiteanya mba US ha kwara ngwongwo ha laa iji bọrọ ọbọ ihe US mere ha. N'egwuregwu Man U na Liverpool A họpụtala Liverpool na Manchester United na otu egwu bọlụ ga-esọ kwakọrịta mpị na egwuruegwu iko International Championship. Real Madrid, AC Milan na Juventus ga-eso sọọ ya bụ mpi nke a na-atụ anya a ga-agba na Michigan US n'ọnwa July. Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ụzọ atọ nwaanyị sị kwesi idozi onwe ya. Ụzọ atọ nwaanyị kwesiri idozi ahụ ya Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa" afirika-44165620,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44165620,Ọbụ gini na-eme na registri Ikoyi,Nchọpụta BBC mere na-egosi na akụko pụtara na ụlọikpe enyere iwu ga-akwụsị idebanye aha alụm di na nwunye n'Ikoyi akwuchaghị ọtọ.,"Ụfọdụ ọchịchị ime obodo chọrọ ka gọọmentị etiti sepụ aka na ịgba ndi mmadu akwụkwọ Ọtụtụ ọchịchị ime obodo gwara ọlụikpe ka ọ kwụsị registri nke dị n'Ikoyi, Legọsị na registrị ndị ọzọ dị n'aka gọọmentị etiti inye ndị mmadụ akwụkwọ alụm di na nwunye maka na ha enwegi ikike ya n'akwụkwọ iwu Naịjirịa. N'oge nke a mechara ihe mere, ndị mmadụ buru akụkọ na akagbụọla inye akwụkwọ na registri Ikoyi, na ọ bụ sọsọ na ọchịchị ime obodo nwere ikike a. Mana onye ọkaiwu bụ Sonnie Ekwuwosi gwara BBC Igbo na onweghị ihe mkpebi a mebiri. O kwukwara ka di na nwunye debara aha n'Ikoyi registry' n'oge gara aga ghara ị tụ ụjọ makana asambodo ha nwereisi. Ekwuwosi kwuru na ọ bu ndị ga-emebi iwu a site ụgbua ga-enweta asambodo na-abaghị uru. Ndị mmadụ ka na-agba akwụkwọ na registri Ikoyi Mana kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara ọchịchị ime obodo na Legọsị bụ Muslim Folami kwuru a ga-eme ka ozi a ruo ndị niile o metutara nti O kwukwara na mkpebi a pụtara na ndebanye aha n'akwụkwọ ọ bụla e mere n'ụlọọrụ ọchịchị kwụ chịm. Mana Salome Njoku, bụ onyeisi na ngalaba na-ahụ maka ihe amala na ministri nke na-ahu maka ihe na-eme n'ime obodo, gwara BBC na ụlọikpe amachịghị registri Ikoyi ịgba ndi mmadụ akwụkwọ. Njoku kwuru, ""Ihe gọọmentị Legọsị na-ekwu adịghị mma ma cha, ọkachasị etu ha siri kwuo ihe ezighiezi maka ihe ụlọikpe kwuru."" Njoku kwuru na ọkaikpe ha na-ahazị okwu, na ha ga ekwupụta uche ha maka okwu a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44950342,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44950342,Ọkụ latrik agaghị enwu ọfụma ruo afọ 2023 - Ndị ọrụ latrịk,Ndị na-eke ọkụ latrịk na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigerian Electricity Distribution Companies' na bekee ekwuola na ọ ga-ahịa ahụ ike ọkụ latrịk na Naịjirịa nke ọma ugbua n'ihi ụgwọ ha ji ndị ụlọakụ kara nkụ.,"Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghi ọkụ afọ ruo afọ Ha kwuru na ọ bụghị na gọọmentị abanyeghị n'okwu a n'ike, nsogbu nwere ike iru afọ 2023 tupu o bie. Ndị ọrụ a ha na-akpọ Discos n'ichafu kwuru na ugbua, ọtụtụ ndị ọrụ ha emechiela ụlọọrụ ha maka na ego ha-anata ndị mmadụ dịka ụgwọ ọkụ erughị ego eji azụ ọkụ a. Ha kwuru na nsogbu a bụ ihe na-emetụta ha niile n'ala a. BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Ikeja Distribution Company bụ Felix Ofulue ajujụọnụ gbasara nsogbu a, o kwuru na ndị ọrụ ike ọkụ latrịk na Naịjirịa nọrọ n'etịtị ọkụ na osimiri. Gịnị bụ nsọgbu ha? Ofulue kọwara na iwu gọọmentị kpebiri na ha agaghị ewelite ụgwọ ọkụ cha cha na-egbu ụlọọrụ dị iche iche na-eke ọkụ latrik na Naịjirịa maka na ego ọrụ e ji emeputa ọkụ latrịk arịala elu. Gainji Dam bụ ebe ama ama na-amipịta ọkụ na Naịjirịa Ofulue kwuru: ""Cheta na ego ịzụ mmanụ gaas arịala elu. Ebee ka anyị ga-ahụ ego ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị akwụ ụgwọ ọkụ?"" Onye ọzọ aha ya bụ Okey Okere bụ ọkachamara n'ihe gbasara ọkụ latrik kọwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị na-eke ọkụ na Naịjịrịa na-ata ahụhụ. Mana o kwuru na ọ bụghị iwelite ụgwọ ọkụ ga-ebi nsogbu a. N'ọnụ okwu ya: ""Oge eruola ka ndị Discos tinye ego na ngwa ọru ha."" Mana Naịjirịa ọ ga-echenwu afọ 2023? Ihe a bu nke na-agbakasị ndị mmadụ isi. Stephen Mbonu gwara BBC Igbo na ihe a pụtara na ite nsogbu ka na-asụ pụtụpụtụ n'ike Naịjirịa. Okere kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ka ndị mmadụ nkiti tinye aka n'ọrụ ike ọkụ na Naijirịa, nsogbu a ga-adị ruo ebiebi. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48970858,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48970858,Nigeria vs Algeria: Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi,Ọljiria ga-ezute Sịnịgal n'agba ikpeazụ dịka Riyad Mahrez ji goolu zọpụta ndị otu ya.,"Ebe Naịjirịa ga-ezute Tunishia ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị, ebe ha ga-ama onye ga-agba onye nke atọ ma nweta ọlanchara. Goolu Mahrez nyere si na 'free kick' ọ gbara dịka Wilfred Ndidi gbaturu Ismael Bennacer. Mahrez dọriri neetị na nkeji 90+4 tupu e gbuchie bọolụ ma mewaa ndị Naịjirịa obi. Odion Ighalo ji penariti nye goolu ma napụta Naịjirịa n'aka ndị Ọljiria na nkeji 73, mana o zughi ịkpọba Naịjirịa n'agba ikpeazụ. Goolu a bịara ka Aissa Mandi tinyere aka ya iji gbochie bọọlụ Oghenekaro Etebo gbara; e ji ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) nyochaa ya ma nye Naịjiria penariti ahụ. Goolu a Ighalo nyere bụkwa naanị nke abụọ na-abanye n'ime poostu ndị Ọljiria kemgbe ha bịara asọmpi nke afọ a. Goolu a Ighalo nyere emeela ya goolu anọ ọ na-enye n'asọmpi a, ma mee ka ọ bụrụ onye kacha nye goolu ugbua. Bọọlụ biri William Troost-Ekong n'ahụ ma banye na neetị na nkeji 40, iji mee ka Ọljiria jiri otu ọkpụ na-emeri Naịjiria. Cheta na ọ bụ Troost-Ekong nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri n'aka Saụt Afrịka ma banye agba ọkara-Ikpeazụ a. Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ewe iwe na-ekwu na ọ bụ uwe ndị Super Eagles yi mere ha ji ghara ịgbata ọfụma n'egwuregwu a. Ha gara na Twitter na-egosi iwe ha. Lee ihe ha kwuru: @sp_okpara kwuru na uwe a anaghị eweta ihe ọma. @Quadriagboola gosikwara iwe ya. @ruudboie kpọkuru ndị na-eme uwe Naịjirịa sị ha gbanwee ya makana ọ na-ebute ọdachi. Mana ajụjụ bụzị ""ọ bụ Jersey na-agba""? Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya na Facebook anyị: Ụfọdụ ndị ọzọ malitere ịchọ Vincent Enyeama chebuuru Naịjirịa goolu. @akaninh kwukwara otu ihe ahụ. Kedụ etu obi dị gị ugbua? Ndị Super Eagles ga-eji ihe niile ha nwere gbaa egwuregwu a, enweghi ihe ọzọ ga-ebute nke a, ọ bụrụ maka nkwa ndị ojiegoachụego kwere ha maka inye ha puku dọla iri ise maka goolu ọbụla ha ga-enye. Amụbeghi Riyad Mahrez mgbe Ọljiria butere naanị otu Iko Mba Afrịka ha nwere; n'afọ 1990." afirika-51757343,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51757343,Coronavirus: Kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ edebe maka adịghị ama ama?,"Ihe karịrị mmadụ 95,000 na mba 79 dị n'ụwa bụ ndị buterela ọrịa coronavirus.","Dịka ọrịa a na-ekesa n'ụwa niile, egwu ji ndị mmadụ nke mere na ọtụtụ na-azụkọba ihe maka ọ gbajuo dọrọ ma egwu bụrụ onye nọrọ be ya. Mana kedụ ihe ndị mmadụ na-azụ, kedụ ihe na-akọzị ụkọ ugbua? Lee ụfọdụ n'ime ha: Ịchafụ mkpuchi ihu E nwere ụkọ ihe mkpuchi imi naz mba Thailand na South Korea N'agbanyeghị na o zughi oke na mgbochi ọrịa a, ịchafụ mkpuchi ihu bụ ihe a na-achọsike dịka akara ọkụ n'ọdọahịa, ọdọọgwụ nakwa n'Amazon kemgbe ọrịa Coronavirus bidoro. Miguel Luiz Gricheno bụ onyeisi ụlọọrụ mba Brazil na-emepụta ịchafụ mkpuchi ihu gwara ụlọntaakụkọ Reuters na, ""Ndị mmadụ na-achọ ịchafụ mkpuchi ihu ka a na-achọ ọlaedo."" Ụlọọrụ ya ji mmaji abụọ welite aka n'imepụta ịchafụ mkpuchi ihu dịka ndị mmadụ na-achọ ya. Nwa mpekere ngwa ahụike abụrụla ihe mba dị icheiche na-achọ achọ maka ndị ọrụ ahụike - ndị nwereike ibute ọrịa ahụ oge ha na-elekọta ndị ọrịa. Otu Ahụike mbaụwa bụ WHO kwuru na ndị ọrụ ahụike nwere mkpa ịchafụ mkpuchi ihu ruru nde 89, na mkpunaka (gloves) dị nde 76 nakwa igegbe anya dị otu nde na ụma isii maka nnyocha ahụ. Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus sị, ""Ụkọ mere na ndị dọkịta, nọọsụ nakwa ndị ọrụ ahụike enweghi ngwa ọrụ zuru oke maka ọrụ ha."" WHO na-ekwu na e nwere mkpa ịchafụ mkpụchi ihu dị nde 89 maka igbochi ọrịa coronavirus Na mba South Korea, bụ ebe nke abụọ kachasị nwe ọrịa coronavirus, gọọmenti kwuru na ha na-amachi ibupu ịchafụ mkpuchi ihu na mba ndị ọzọ, iwelite mmepụta ya nakwa ịhụ na onye ọbụla anaghị azụkarịa ole ga-ezuru ya izuụka abụọ. Onyeisiala mba ahụ bụ Moon Jae-in arịọla mgbaghara maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu ma gwa ụlọọrụ na-emepụta ya na gọọmenti ga-amapụta ebe ndokwa ya - ka ha ghara ịtụ uche maka imepụta ya ebe ọ gafere oke. Na mba Thailand, ebe enwere mgbaka ahụ maka ụkọ ịchafụ mkpuchi ihu, gọọmenti hiwere kọmitii lebara anya ịmata ma a na-ebupu ya na nzuzo maọbụ na-ere ya oke ọnụahịa n'azụ ụlọ. Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron sị na ha ga-enye ọrụ ahụike nakwa ndị bu ọrịa coronavirus. Mmanụ mgbochi ọrịa(Hand sanitisers) Mmanụ e ji egbochi mgbochi nje ifesa bụ ihe a na-achọ ka akara ọkụ dịka ndị mmadụ na-agba mbọ igbochi mfesa ọrịa Ọnụahịa ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ e ji egbochi mfesa nje arịala n'elụ oji dịka ọ na-adazị mmaji abụọ ihe a na-azụ ya na mbụ na Naijiria. Na mba France, gọọmenti na-agba mbọ ibu agha mmegide ndị na-ere ahịa ngwa nchekwa ahụike n'azụ ụlọ Minista na-ahụ maka ego na mba ahụ kwuru na igwe Twitter ya sị ""Ejikerela m iji iwu tinye anya na-ego ole a na-ere ịchafụ mkpuchi ihu nakwa mmanụ mgbochi nje ma oke ọchịchọ karịa."" Na mba Pakistan, gọọmenti dọọ ndị ahịa aka na ntị maka iji oke ọchịchọ soo ngwa ahịa nchekwa ahụike nakwa ọgwụ. Mịnịsta ahụike mba Iran kwuru na ụfọdụ ndị ahịa na-akpachi ihe ha nwere ma na-ere ya oke ọnụahịa. Dịka ụlọakwụkwọ akụkọ mba Russia bụ Vedomosti, sị kwuo, ndị na-achọ mmanụ mgbochi, ncha nakwa akwụkwọ mposi n'ụlọahịa ọgwụ nakwa ahịa ịntanet n'ọnwa gara aga. Akwụkwọ mposi Akwụkwọ mposi kọrọ ụkọ na ọdọahịa dị na mba Australia Dịka mmadụ ịnọrọ na be ya, sị n'ụlọ na-arụ ọrụ mabụ hapụ ịga akwụkwọ na-agbanyewanye mgbọrọgwụ,ndị mmadụ na-azụkọsị ihde dị ha mkpa maka adịghị ama ama. Na mba Singapore, Japan na Hong Kong, e nwere ụkọ akwụkwọ mposi. Na mba Australia, ike e ji achụ akwụkwọ mposi mere ka ọdọahịa tọgbọọ chakoo na egbughị oge nke n'otu ọdọahịa nyere iwu mmadụ azụla karịa akpa anọ akwụkwọ mposi. Ọ bụghị naanị akwụkwọ mposi ka a na-achọzi achọ ugbua kama akwụkwụ a na-awanye ụmụaka nakwa ara ehi sokwa. Ngwa nri Ụkọ nrị adịghị na mba Briten mana o siri ike ndị tụrụ ahịa nri na ịntanet inweta ya n'ọnụ ama ha N'afọ gara aga, pasent 45 ndị na-azụ ahịa na mba Briten zụrụ nri n'intanet nke na ndị nwere ọdọahịa (supermarket) na-adọ aka na ntị na ọ ga-aka njọ n'afọ dịka ọrịa coronavirus na-aga n'ihu. onye chọọ ka ebutere ya ngwa nrị ọ zụụ ka eji n'oge kwuo ihe ọ chọrọ abali ole na ole tupu oge ọ ga-adị ya mkpa mana ha kwuru na e nweghị ụkọ ọbụla. Mkpụrụọgwụ Mba India bụ ha na-emepụta pasent 20 ọgwụ a na-aṅụ na mbaụwa gụnyere ọgwụ paracetamol bụ ọgwụ e jikarị agwọ ahụmgbu kwuru na ha ga-ewetu aka n'ọgwụ ha na-ebupu na mba ha - maka na ọ bụ Chaina ka ha si enweta oke abụọ n'ime oke atọ n'akọọngwa ha ji arụ ọgwụ ndị a. Mana gọọmenti India kwuru na egwu adịghị na ọgwụ ga-anọru ọnwa atọ. Nchọpụta BBC mere gosiri na enwewala ụkọ ọgwụ na Naijiria na mba Kenya. Ọnụahịa ọgwụ gbaliri mmaji atọ na Kenya ,ebe ụlọakụkọ Daily Trust gbara ama na ụka ọgwụ ga-ebido na Naijiria maka mkpebi a India mere." afirika-50032212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50032212,No Bra Day: Gini ka ụbọchị a pụtara?,"Dịka ọ na-ewu n'ebe niile, ọtụtu ndị mmadu nwere nghọtaghịe ihe ụbọchị a bụ maka ya. Etu ụbọchị a siri Bido","Dịka ndị otu Cancer.ca siri kọwaa, ọ bụ Dọkinta Mitchell Brown bịdoro ụbochị a i ji mepee anya ndị mmadụ maka ihe gbasara ọrịa kansa n'afọ 2011. Brown kpọrọ ya 'BRA Day' nke pụtara ""Breast Reconstruction Awareness Day"". #NoBraDay: Ọ ga-akwụsị ọrịa kansa n'ụmụnwanyị? Ebum n'obi Brown bụ ị kụziri ụmụnwaanyị ndị a ga-awa ara maka ọrịa kansa na ha nwere ikike ị sị ka awa ha ara ma meekwa ya ka ọ dị mma . Nke a ka ndị Bekee na-akpọ 'Reconstructive Surgery'. Afọ atọ ka ọ were ka emume a gazụọ mba iri atọ. Ka oge na-aga ka atụghaghịrị aha ụbọchị a site na BRA DAY ọ bụrụzia No BRA Day, nke mere ka ọtụtu ndị mmadụ aghọtaghe ya. Ọ na eme Nwoke na Nwanyị kama ọkacha eme ụmụnwanyị ebe ihe pekarịrị 1% n'ime ụmụnwaoke (Dika Nna Beyounce Knowles bụ Mathew Knowles) otu narị na-enweta ya. Otu ihe ikwesiri ime i jị gbochie Kansa Ara Ịchọpụta n'oge Enwere ụzọ abụo esi achọpụta ma mmadụ enwere Kansa ara. 2. Nke abụọ bụ ịga ụlọ ọgwụ ka ha nyocha ara gị Nwaanyị ji igwe kọmpụta enyocha ara maka kansa Onye meriri ọrịa kansa Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụbọchị taa Nwaada a na-akọwa na ọ bụ ụbọchị maka Kansa Ara na ọ bụghị maka ịgba ọtọ Nwaada a na-egosi ụmụnwanyị etu ha ga-esi nyocha onwe ha maka kansa ara. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkịrị ga-amasị gị King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12" afirika-48995855,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48995855,Keke ga-ebidozi gbawa ruo elekere itoolu n'Aba na Umuahia,Odeakwụkwọ mgbasa ozị gọọmenti Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na gọọmenti Steeti ahụ agbatịala awa ndị keke na-arụ ọrụ na Steeti ahụ site elekere asaa ruo elekere itoolu nke abali.,"Keke ga na agbaruzi elekere itoolu nke abali Gọọmenti Abia steeti gbubiburu awa ndị Keke ji arụ ọrụ ruo elekere asaa ụbọchi niile maka mpu na ohi a na-ebo ndị ọrụ ahụ. Mana ugbua, Ememanka kwuru na ndị otu keke akpọrọ Abia State Amalgamated Tricycle Owners Association kwetere na ha ga-etinye aka na-ikpochapụ ndị ajọọ mmadụ nọ n'ime ha igbochi iji ya bụ ụgbọ njem eme mpụ. Ememanka sị na "" ọ bụ nke a mere gọọmenti jiri nwee mmasị ịmegharị ya bụ iwu,""nke bụ na ugbua, keke ga na-akwụsịzị n'elekere itoolu nke abalị. Ntọ atọrọla nne Siasia Ndị uweojii na Bayelsa ekwuola na ha na-achọ ndị tọrọla nne Samson Siasia bụbụ onye nchịkọta otu egwuregwu Naịjirịa n'isi ụtụtụ taa. Ndị ntọ a si n'osimiri dị n'obodo Odoni dị na Sagbama bata nwụrụ Beauty Siasia dị afọ iri asatọ ma sikwa ebe ahụ gbalaga. Atọrọla ya n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ Mọnde na be ya dị na Bayelsa Steeti, Onyeisi ndị uweojii na Bayelsa enyela ndị otu ha iwu ka ha banye ọhịa na ụzo niile ịchọta ndị kpara mkpamkpa ahụ, dịka ọnụ na-ekwuru ha bụ bụ Asinim Butswat sị kwuo. Etu nwoke akpọrọ ""Nigeria's Supercop"" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa. Zuma sị na ya abụghị eze mpụ na Saụt Afrịka Onyeisiala mba Saụt Afrika na mbụ bụ Jacob Zuma agọọla na ọ bụghị ya ji okpueze mpụ na mba ahụ. Ọ gwara ndị Ọkaikpe e hibere maka ileba anya n'okwu ya na ebubo ahụ bụ mgbaokpuru agbara iji wepụ ya n'ọchichị. Ọkụ gbara ahịa n'Enugwu Ndị a wụrụ ""acid"" na Mgbuka Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na mmadụ isii n'ime asatọ a wụrụ ""acid"" na Mgbuka Obosi, anatala ọgwụgwọ ma laa be ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, kwuru na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ. Obasanjo ataala ụkwa jaa eze Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ataala ụkwa jaa eze n'akwụkwọ o zigaara Onyeisiala Muhammadu Buhari. Ọ dọrọ aka na ntị na Naịjirịa na-akpọda ndagwurugwu nke ọnwụ, na ọ bụ naanị onyeisiala nwere ike ịdọpụta ya. Wike emeriela n'ụlọikpe kacha elu Ụlọikpe kachasị elụ na Naịjirịa ewezugala akwụkwọ Elvis Chinda gbara Gọvanọ Nyesom Wike maka asambodo ụbọchị amụrụ ya. Elvis Chinda rịọrọ ụlọikpe ka ọ napụ Wike ọchịchị maka na asambodo ncheta ọmụmụ ya gbara mpe. Iker Casillas sozi na ndị nchịkọta na Porto N'egwuruegwu, ụmụibe Iker Casillas esila na ochee goolu ndị Porto banye n'ọkwa onye nchịkọta na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'otu egwu bọọlụ ahụ. Casilla bụ onye si n'akwa ọrịa obi kulie ọnwa abụọ gara aga, sị na ya ga-anwa ike ya. Gee akụkọ BBC na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkụ ga-amasị gị" afirika-53072719,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53072719,Arsenal vs Man City: Man City achụghachịla Arsenal na 'lockdown',Goolu Raheem Sterling nyerela Man City zuru iji kpọpee ọnụ ụzọ ka mmiri zobata.,"Goolu a e nyere na nkeji 45 n'ọkara nke mbụ, mere ya mbụ a na-enye n'asọmpi Premier League dịka a na-amalite ya bụ asọmpi ka ụbọchị 100 e ji kwụsịtụ ya n'ihi mkpamkpa coronavirus gachara. Kevin de Bruyne ji penariti nye goolu nke abụọ na nkeji 51, dịka David Luiz - e webatara nwa obere oge tupu ọkara nke mbụ agwụ - ji aka dọtuo Riyadh Mahrez. A chụpụrụ Luiz n'agbanyeghi na ndị otu ya na-aba mba na-aba mba na-asị na enweghi ihe o mere. Na nkeji 90 na ụma a ga-eji egbuchi bọọlụ, Phil Foden nke Man City emezuo ya atọ site na bọọlụ Sergio Aguero chọrọ mma, iji tinye Arsenal na ndị na-akwado ha n'obi mgbu. Mara na Man City mechara fọ naanị mmadụ 10 n'ọgbọegwuregwu oge Eric Garcia pụrụ, nke a mere n'ihi na ha agbanwechaala mmadụ ole ha nwere ike. A tụkwasịkwuru nkeji 12 n'elu nkeji 90 e ji gbaa bọọlụ a n'ihi ọtụtụ mmerụ ahụ na oge e gburu n'ịṅụ mmiri n'ihi mkpomọkụ dị ebe ahụ. Arsenal gara njem n'ọgbọegwuregwu Etihad bụ be ndị Manchester City, ebe ha gbara egwu onye ike ga-agwụ, mana Man City tiri ha mmọnwụ. N'ime nkeji 25 e ji bido bọọlụ, mmadụ abụọ na-agbara Arsenal - Granit Xhaka na Pablo Mari Villar - pụkwara site na mmerụ ahụ. Ọ bụrụ na Arsenal meriri Man City, Liverpool ji pọịntị 25 aga City, gaara emeri ma bụrụ ndị butere iko Premier League nke afọ 2020 a. Mana oge ka dị. Ka ọ dị ugbua, Arsenal ga-ezute Brighton n'egwuregwu ọzọ ha ga-agba." afirika-49432478,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49432478,Rochas Okorocha: PDP Imo state ekpesala ya n'aka ndị uweojii,"N'Imo steeti, ndị otu pati Peoples Democratic Party (PDP) edegarala onyeisi ndị uweojii akwụkwọ mkpesa megide aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha.","Ha kwuru na Okorocha na-akwado atụmatụ dị iche iche ọ ga-esi bute ọgbaaghara, nke ga-eme ka gọọmentị etiti weghara ọchịchị steeti ahụ. Odeakwụkwọ ndị PDP na steeti ahụ bụ Nze Rar Emeana, dere sị na ha chọrọ ka onyeisi ndị uweojii steeti ahụ tinye anya na ya bụ okwu, makana ha agaghị ejitenwu ndị Imo steeti ma ha bido ịkpa ike. Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ Gọọmenti Enugwu steeti ebidola ịsụ ọhịa dị n'okporoụzọ awaraawara, iji kpochapụ ebe ndị ntọ na ndị ojiegbeezu na-ezo akpa ike. Cheta na nso nso a, ndị omekome egbuola ihe gụnyere otu ụkọchukwu nakwa nwaanyị di ime, ma tọrọ otu igwe na nwunye ya. Lee ihe ha mere: 'Anyị na-ekpochasị ọhịa iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo' N'ofesi, E ji ụgbọelu helịkọpta anọ bịa gbatara ha ọsọ enyemaka Amụma esegbuola mmadụ atọ so na ndị bịara nlegharị anya ma merụọ 22 ndị ọzọ ahụ ka oke mmiri malitere izo n'ugwu dị na mpaghara ndịda Poland. Akụkọ si mba ahụ kwuru na otu nwatakịrị dị afọ 13 so na ndị o gburu. N'egwuregwu, Ala eriela ihe o! Ifeanyichukwu Chiejine anwụọla ka ọ rịachara obere ọrịa. Chiejine gbara n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị atọ, Olimpiks abụọ ma butekwa Iko Mba Afrịka anọ Chiejine, onye gbabuuru otu Super Falcons bọọlụ, nwụrụ n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ọ gbachara afọ iri atọ na isii dịka ozi si NFF siri kwuo. Gụọ maka ya n'uju ebe a: Ifeanyi Chiejine, onye gbabuuru Super Falcons, anwụọla A chụọla onyeagha gbagburu mmadụ n'Aba n'ọrụ Ndịagha Naịjirịa nke ngalaba 82 Division achụọla onye otu ha aha ya bụ Ajayi Johnson bụ onye eboro ebubo na ọ gbagburu otu nwata nwoke n'Aba n'ihi na ọ jụrụ inye ya ngarị otu narị naịra. Ha kwuru na e bu ụzọ kpee Ajayi ikpe dịka iwu ndị agha siri dị ma wetuo ya n'ọkwa tupu ha achụọ ya n'ọrụ. Ọnụ na-ekwuru ndịagha n'Enugwu bụ Aliyu Yusuf, kwuru na ha agaghị agba nkịtị ma onye otu ha kpaa agwa na-ekwesịghị ekwesị. O kwukwara na ha enyefeela Johnson n'aka ndị uweojii ka ha metọpụ nke fọrọ afọ. Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị? Buhari achụghị Lauretta Onochie Laureta Onochie na-ekwe onyeisiala Buhari n'aka. Akụkọ na-efegharị na soshial midia bụ na onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ọtụtụ ndị enyemaka ya ọsọ bụ asị asị. Dịka akwụkwọ ozi si Aso Rock pụta ụnyaahụ kwuru, ma Lauretta Onochie, Bashir Ahmed, Tolu Ogunlesi ka jịcha ọkwa ha jibu mbụ, tinyekwara Femi Adeshina na Garba Shehu. Buhari họtakwara ogbo ya bu Buhari Sallau dịka onye enyemaka mgbasa ozi. Sallau nọchịrị anya Shaaban Sharada bụ onye bụzị onye omeiwu na Kano Steeti. Ndị ọzọ a họrọ n'ọrụ ọhụrụ bụ: Ahmad Zakari - onye enyemaka gbasara ọrụrụ ihe Obafela Bank-Olemoh - onye enyemaka n'ihe gbasara ịgụ akwụkwọ Louis Odion - onye enyemaka mgbasa ozi akwụkwọ akụkọ, nakwa Ajuri Ngelale - onye enyemaka mmekọrịta ọhaneze. Mba Sudan enweela onyeisiala ọhụrụ Abdalla Hamdok, Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Sudan. N'ofesi, mba Sudan ahọpụtala Abdalla Hamdok dịka Praim Minista ọhụrụ ga-anọ n'ọkwa ruo afọ atọ iji weta ọchịchị ndị agha n'isi njedebe na mba ahụ. Hamdok rụburu ọrụ dịka otu n'ime ndị welitere isi n'ọgbakọ mba ụwa bụ United Nations. Chukwueze onye aka nchawa Samuel Chukwueze bụ onye aka nchawa Otu bọọlụ Villareal nke mba Spain etunyela nwaafọ Igbo bụ Samuel Chukwueze ugo dịka ọgba bọọlụ nwetara aka nchawa n'afọ gara aga. Toko Ekambi nke mba Cameroon ritekwara onyinye dịka onye kacha nye goolu ebe Santi Cazorla tuuru ugo dịka onye kacha gbaa bọọlụ n'afọ gara aga. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha" 44769448,https://www.bbc.com/igbo/44769448,Ihe mere eji kpụpụ nwa Zuma ụlọikpe na South Africa,"Ka ndị mba Saụt Afrịka na-enyocha onye bụbu onyeisiala ha bụ Jacob Zuma na nwa ya nwoke, ajụjụ bụ 'ụdịrị ihe a a ga-emenwu na Naịjirịa?'","Duduzane bụ nwa Jacob Zuma na-aga ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya gbasara ebubo mpụ na nrụrụaka ọkachasị nke metụtara ezinaụlọ Gupta bụ ndị a ma ama na mba Saụt Afrịka. E nyere Duduzane, dị afọ 34, ihe Bekee kpọrọ 'bail', n'agbanyeghị na a tụrụ ya ịga n'ụkwụ ya oge e dubatara ya n'ụlọikpe. N'afọ 2017, Duduzane gwara BBC na aka ya dị ọcha, na ọ naghị eme mpụ na nrụrụaka. Content is not available End of YouTube post, 1 Ka ọtụtụ afọ gafere, Duduzane na-agọ ụkwụ ya na aka ya na o jighị ọnọdụ ya dịka 'nwa onyeisiala' etinye ego n'ezinaụlọ Gupta. @AdvBarryRoux jụrụ ma ịtụ ya ịga a dị mkpa? Ebe @vuyo_ro na-ajụ ihe kpatara a ga-eji nwụchie ya ebe ndị kpasara ha oke nke 'apartheid' na-agagharịrị onwe ha. Isi na isi: Naịjirịa na Saụt Afrịka Na ụlọikpe kwuru ka a hapụ ya na 'bail' emeghị ka ọ laa na nta, maka na ọ ga-alaghachị n'ụbọchị 12 nke Julaị afọ a, ịzara ọnụ ya maka onye nwụrụ oge ụgbọala 'Porsche' ya na 'minibus' bụ ndị mmadụ sukọtara n'afọ 2014. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47580196,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47580196,Arsenal vs Rennes: Arsenal anapụtala Rennes isi ha,"Goolu abụọ Pierre-Emerick Aubameyang nyere na nkeji ise na nkeji 72, na nke Ainsley Maitland-Niles nyere na nkeji 15, zuru ịkpọ ntu n'akpati e ji lie olileanya Rennes.","Arsenal anapụtala Rennes isi ha Aubameyang ghọrọ agụ n'ọgbọegwuregwu, were bọọlụ gbakasịa ndị Rennes ahụ. Ka o nyere goolu nke abụọ ya, Aubameyang fụrụ ekpo ""black panther"" ọ tọgbọrọ n'azụ poostu, mere ka ogbubọọlụ nye ya akwụkwọ mme mme nke ịdọ aka na ntị. ( Cheta na Rennes mere Arsenal echeta ebewe ka ha ji goolu atọ merie ha mgbe ha zutere na Roazhon Park n'izu gara aga. Mana Arsenal mere ha ""ị gaghị akparị mmadụ n'ụlọ ya"" ka ha enyeghi ha ohere ikuru ume ndụ n'ọgbọegwuregwu Emirates. Mmeri a Arsenal ji mkpokọta (4 - 3) merie, enyela ha ikike ibanye n'agba anọ-ikpeazụ. Chetakwa na asọmpi Europa League a bụ ihe Unai Emery bụ onye nchịkota otu Arsenal ji eri; o buliri iko a ugboro atọ oge ọ na-achịkọta otu Sevilla. Ọ ga-ebulatanwu iko a n'Arsenal, ka a ga-agbaji ya aka." egwuregwu-43793206,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43793206,Commonwealth: Otu Naịjirịa gara asọmpi ga-alọta echi,"Otu nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Commonwealth emere na mba Australia, ga-alọghachite Naịjirịa n'ụtụtụ echi.","Otu Naịjirịa na-emekarị ọfụma n'asọmpi Commonwealth kwa mgbe kwa mgbe Naịjirịa mere ọfụma ma nweta nchịkọta ihe nrite ọla iri abụọ na anọ (24) nke bụ ọlaedo itoolu (9), ọlaọcha itoolu (9) na ọlanchara isii (6) n'ime egwuregwu itoolu ha so sọọ mpi. Otu a nọchitere Naịjirịa ga-alọta dịka dike, site na mba Dubai, ebe ha ga-eji ụgbọelu Emirates abụọ. Ụfọdụ ga-efedata na Lagos ebe ndị ọzọ ga-efedata n'Abuja. Minista na-ahụ maka egwuregwu bụ Solomon Dalung, toro ike ndị otu a ma kwuo na ha mere ọfụma n'asọmpi a karịa asọmpi ndị Naịjirịa merela n'afọ ndị gara aga. Dalung kwuru ""Anyị enyochaala omume anyị n'asọmpi Gold Coast ma chọpụta na ị tụnyere etu ndị otu gara asọmpi egwuregwu Glasgow na ndị anyị kpọgara Gold Coast ha n'ibu, ị ga-ahụ na otu nke a mere ọfụma karịa.""" afirika-50510171,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50510171,Manchester United vs Sheffield United: Man Utd alaala na mgbuka?,Ụwa gbara Ole Gunnar Solskjaer gharịị n'ọgbọegwuregwu Bramall Lane ka Sheffield sachara goolu nke atọ ha chọrọ iji merie ha bụ nke ha ji gbata ọkpụ atọ onye lawa.,"Ole Gunnar Solskjaer na-eche ihe ya n'ụwa ga-eje Ọrụ a adịghịri Ole Gunnar Solskjaer mfe kemgbe Maachi afọ a o nwetachara ya bụ ọrụ. Sheffield ji otu ọkpụ sị Manchester United ndewo na nkeji 19' amalitechara ya bụ asọmpi bụ nke John Fleck fekenyere n'ọnụ mpịọ ndị Man U bụ nke gooli kụnyere na mpio ha. Sheffield jisiri ya bụ goolu ike ruo mgbe a gara ezumike. Ka a batara ya bụ ezumike, Manchester United ritere akwụkwọ ịdọ aka na ntị site na ajọ agwa Brandon Williams na nkeji 50' ebe ha na-esị ọnwụ goolu. Mana obi siri Sheffield United ike dịka ha nyere goolu nke abụọ na nkeji 51 site na'aka Lys Mousset. Manchester United gwara ha na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa dịka ha tetere n'ụra na nkeji 72' mgbe Brandon Williams gbaara isi onwe ya na goolu mbụ ha. Daniel James nke Manchester United nyere onye otu ya bọọlụ Goolu nke abụọ ha sochiri ha azụ na nkeji 77' mgbe Mason Greenwood zara aha ya bụ nke mere ya 2-2. Na nkeji 79' Marcus Rashford tinyere goolu nke atọ ha na mpio ndị Sheffield bụ nke mere ya 2-3. Ihe mere ndị Sheffield. Mgbe ahụ ka a malitere ị gọ ọfọ ọbịara be onye abịagbule ya. Chi ha zara ha ya bụ ekpere na nkeji 90' kpọmkwe tupu egbuchie ya bụ egwuregwu bụ mgbe ha sara ya bụ goolu ha jiri gbaa 3-3. Ọ bụ n'ụkwụ Oliver McBurnie ka Sheffield sị saa ya bụ goolu. Ọdachị ụgbụelụ Congo Ụgbụelụ a kpọgharịrị ụgbọrọ atọ n'elụ tupu ọ kụjaa n'ala Ụmụibe ka ọ dị ugbua, agụtala mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị nwụrụ na ya bụ ụgbọelụ dakwasara ụlọ na Democratic Republic of Congo. Otu ezinaụlọ mmadụ itoolu so na ya bụ ọnụọgụ. Ya bụ obere ụgbọelu dakwasara ụlọ n'ogbe Mapendo ka ọ fuchere ụzọ ya mgbe ọ na-efeli na ọdọụgbọelụ dị na ugwu Kivu, dịka Gọvanọ Nzanzu Kasivita kwuru. A na-akọwa na ọ bụ ndị ọrụ mmadụ iri na asaa nọ na ya bụ ụgbọelụ mgbe ọ kpọkasiri. A ma Congo dị ka obodo ihe mberede ụgbọelụ na-emekarị. Nke a mere ejighị ekwe ụgbọelụ ndị njem ha febata mba Europe Union. Ndị mmadụ gbakọrọ ịma ma ha a ga-enyerenwu onye ọbụla na-anwụghị aka Ihe a ma maka ihe mberede a mere? Ụgbụọelụ a bụ Dornier-228 ""twin turbprop"" bụ nke ndị ụlọrụ Busy Bee kpọjara otu nkeji ofelichara, dịka otu onye nọ n'ọdọụgbọelụ Goma gwara BBC. Ya bụ ụgbụelụ kwesiri ị ga Beni dị kilomita 350 n'ụgwụ Goma. O dobeghị anya ihe butere ya bụ ọdachị mana ndị mmadụ na-ekwu na njin ya adịchaghị mma dịka ofeliri dịka onye ọrụ BBC bụ Emery Makumeno sị kọọwa na Kinshasa. Ndị ọrụ gbata gbata na ndị agbataobi gara ebe ahụ ozigbo ịzọpụta ndị mmadụ nakwa ndị nwụru anwụ. A matabeghị mmadụ ole nọ n'ụlọ be ha mgbe ya bụ ọdachị dara. Gọvanọ Kasivita bụ onye kwuputara ya bụ ọdachị sị na ""ya bụ ihe lara mkpụrụobi ndị obodo ha n'iyi"", ma kasịkwa ha obi. BBC a kpọọla Busy Bee maka ọnụokwu ha. Umahi sị na ụbịam adịghị n'Ebonyi ka e si ekwu David Umahi agwala ndị sị na Ebonyi steeti gbara ndị nke asaa n'ụbịam na Naịjirịa ha gaa chiri akwa ha ebe ha sara ahụ. Umahị sị na ihe ahụ bụ akaọrụ ndị obi akpọ chọrọ iduhie ndị mmadụ ụzọ. Onye nọ na nga ezutele ọnwụ ya Onye a tụrụ ịga Ọzọ kpọtụrụ taa bụ na otu onye mkpọro anwụọla n'ụlọmkpọrọ ndị na Eket dị na Akwa Ibom steeti. Onyeisi ụlọmkpọrọ ahụ bụ Alex Oditah sị na ha na-etinye anya ịmata ka ya bụ mmiri sị baa opi ụgbọghịrị. Kụpụrụnụ Chimamanda Adichie aka... Nwaada a nwetara nturuugo na mba Amerịka n'aka otu a kpọrọ 'United Nations Foundation Global Leadership Award', maka etu o si eji ide na ịkọ akụkọ ejikọta ndị mmadụ na omenaala dị iche iche nakwa ịrụtụ aka n'ịkpa oke agbụrụ. Nke a emeela ya onye pekarịchara n'afọ si mpaghara Afrịka na-erite nturuugo a. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'egwuregwu, Manchester United nọ n'ogogo nke iri na tebulu Premier League ugbua, ga-ama ma ọnọdụ ha ọ ga-agbanwe, mgbe ha na Sheffield United ga-ezute. Ebe e ji goolu gbajuo ndị egwu bọolụ Naịjirịa na-agba n'aja afọ, oge Pọtugal ji ọkpụ iri chara acha, saa otu goolu ha ji na-emeri ha, n'asọmpi Iko Mbaụwa na-aga ihu na Paragụaị ugbua. Wilder akụpụla Ortiz ọkwụrụ n'anya Wilder ga-ezute Tyson Fury n'ọnwa Febrụwarị 2020 Ị nụkwara na Deontay Wilder ji ọkpọ kụpụ Luis Ortiz mkpụrụ ọkwụrụ n'anya n'ọgbọọgụ n'agba nke asaa? Mmeri Wilder pụtara na ọ ka ji belt WBC ya nke ugboro iri, n'agbanyeghi na Ortiz yiri ya egwu n'ime agba isii niile ha pịara ọkpọ. Ortiz bụbụ agada gbachiri ụzọ n'ọkara nke mbụ n'ọgụ ha, ruo mgbe Wilder hụrụ ohere wee kụtuo ya ala Lee etu e si pịatuo Ortiz Teknụzụ ga-eme ka Naịjirịa bụrụ mba mepere emepe - Osinbajo Onyeisiala Muhammadu Buhari esila n'ọnụ osote ya bụ Yemi Osinbajo kwuo na e nweghi ihe mere Naịjirịa ga-eji ka dị ka obodo na-emepeghị emepe. Ọ gara n'ihu kwuo, na ọ bụ teknụzụ ga-ebute mgbanwe na mmepe obodo ma ọ bụrụ na anyị jiri ya kpọrọ ihe. Ndị gwuru onye ọcha chandum, Aka ndị uweojii nọ Imo steeti akparala mmadụ atọ gụnyere otu nwaanyị, a na-enyo maka igwu onye ọcha chandum. Dịka Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, mmadụ atọ ahụ anapụtara otu ụgbọala, ekwentị nakwa ihe ndị ọzọ, gwuputere ihe karịrị puku narị asatọ n'aka nwaanyị onye ọcha tupu a nwụchie ha. N'ofesi, Ọtụtụ mmadụ pụtara ịtụ vootu n'ọgbọ ntuliaka Ndị mba Họng Kọng na-eme ntuliaka maka onye ga-abanye n'oche narị anọ na iri ise na abụọ maka ọchịchị ime obodo. Ha na-eche na ọ ga-abụ ụzọ ndị mba ahụ na-eme ngagharịiwe kemgbe ọnwa Juun, ga-esi gosi ebumnobi ha ebe mba Chaịna nakwa ndị na-achị ha, nọ. Ndị pụtara ịtụ vootu nke afọ a karịrị ndị nke pụtara ịtụ ya n'afọ 2015. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Igbos in UK: Lekwa ka ndị Igbo bi na Liverpool si emepụta omenaala Igbo" afirika-55191484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55191484,Afrịka a na-eweghara ọkwa dịka ọgbọ ọgụ agha jihad n'aka Middle East?,"Ihe dịka ndịagha mba Briten mmadụ 300 bụ ihe wuchiri na mba Mali n'Afrịka ebe otu ""Islamic State' dịka ha hapụrụ mpaghara""Middle East"" bata Afrịka.","Al-Shabab ka na-akpa ike na Somali na-agbanyeghị ọgụ ndị agha megide ha Atụmatụ ahụ ga-anọ afọ atọ nke ha bịara ije ya bụ ihe a kpọrọ ""Operation Newcombe"" bụ nke ha na ndịagha UN dị 15,000 bụ nke mba Fransi nọ n'isi ya na-agba mbọ iweta udo na mpaghara ahụ a ma dịka ""Sahel"". MalibU otu mba n'ime mba ndị nọ zara ndị na-ebu agha megide ndị nnupuisI Jihad, ya bụ ọgụ na-ekpo ọkụ na-aga n'ihu. Dịka ngụkọ maka nsogbu iyi egwu na ụwa nke a kpọrọ ""Global Terrorism Index' nke e wepụtara n'abalị 25 nke ọnwa November, ""ọgbọ ọgụ nke otu ""Islamic State"" bụ IS apụọla na Middle East gaa kụọ akwụ n'Afrịka na mpaghara ụfọdụ na Ndịda Asia (South Asia). Ndịagha Briten na-azụ ndịagha si mba di icheiche ekpokọbara na Mali Na mpaghara Afrịka dị nso na Sahara, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'aka IS ejirila pasent 67 gbalite kemgbe afọ gara aga. Ozi ""Global Terrorism Index"" kwuru sị, ""Mgbasasị otu ha na ISIS jịkọtara mpaghara Afrịka dị nso na Sahara emeela ka nsogbu iyi egwu n'ọtụtụ mba dị na mpaghar ahụ."" ""Mba asaa n'ime iri ndị nsogbu iyi-egwu kawanyere njọ dị na mpaghara Afrịka dị nso na Sahara: Burkina Faso, Mozambique, DRC, Mali, Nijie, Kamerun na Etiopịa"". Ozi ahụ kwukwara na n'afọ 2019, mpaghara Afrịka dị nso na Sahara bụ ndị kachasị nwee ndị nwụrụ site na nsogbu nke bụ 982, maọbụ pasent 41 ndị iyi egwu tara isi ha.. 'Nzọpụ ụkwụ n'ọgụ megide nsogbu ndị oyi egwu' Ndị agha Jihad abụghị ihe ọhụrụ n'Afrịka. N'agba ọhụrụ, onye ndu al-Qaeda leader Osama Bin Laden nwụrụ anwụ mere Sudan ebe obibi tupu ọ laghachi Afghanistan n'afọ 1996. Boko Haram nke Naijiria bụ nke a ma maka ịtọrọ nari kwuru narị ụmụakwụkwụ ụmụnwaanyị na Chibok n'afọ 2014 mere mwakpo ọtụtụ oge dịka ha kwupụtachara na ha na-amalite agha Jihad n'afọ 2010. Mana taa, otu Jihad dị iche iche na-ama onwe ha aka dịka nsogbu iyi egwu na-akawanye njọ. Onye nchịkọta ngalaba gọọmenti Amerịka na-ebu agha megide iyi egwu bụ ambasadọ Nathan Sales, kwuru na IS na al-Qaeda ebupụla isi ọnọdụ ha na Syria na Iraq bugazie ya Ọdịda Anyanwụ na Ọwụwa Anyanwụ Afrịka nakwa mba Afghanistan. Ọ sị, ""Afrika bụ isi sekpụ ntị n'ịga n'ihu n'ọgụ megide nsogbu iyi egwu."" Onye agha mba Mali na-eche ili Askia dị na Gao Mana ọ bụghị naanị nsogbu ndị gọọmenti na ndị oyi egwu, e nwere ekworo onye ka ibe ya n'etiti ndị otu agha Jihad nke al-Qaeda na IS. N'ihi ekworo a, Olivier Guitta bụ ọkachamara sị ụlọrụ ""GlobalStrat Risk Consultancy"" na ekwu na ""Afrịka ga-abụ ọgbọ ọgụ Jihad n'afọ 20 na-abịa, na Afrịka ga-anọchi Middle East"". Al-Qaeda na IS kpọrọ gọọmentị ndị ndịọcha ndị ""West"" na-akwado asị. Mana ụzọ ha si eme nke ha dị iche iche. IS na-eji ihe onyonyo na-awụ akapa oyi dịka ebe a na-egbupu mmadụ isi nke mere o ji adọtara ha ndị omekome obi fere azụ nakwa ndị isi ghasara aghasa, nke mekwara na ọtụtụ ndị Muslim kpọrọ ha asị. Al-Qaeda na ndị otu ha Na-achọnkwado ndị obere mmadụ ekwennyeghị na gọọmenti ha maọbụ ndị uweojii ha nakwa akpamoke ebe onye si. Mba ndị ọ kachasị metụ? Mali na mba ndị ọzọ mpaghara Afrịka dị nso n. ọzara Sahara Mpaghara ahụ ka a na-akpọ ""Sahel"", nke pụtara ""ikperemmiri"" n'asụsụ Arabic .. Mali, Chad, Niger, Burkina Faso na Mauritania bụ mba ndị dị na Sahel. Ha niile na-arịa nsogbu ndị oyiegwu. Ụfọdụ mba ndị a bụ ndị ala ọkpọnkụ, ụbịam, enweghị ọrụ, nrụrụaka ji ọgbọ . Ambasadọ Sales, sị na ""Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ebe a ma na mpiti ga-ekwe n'ihi na ọtụtụ mba ndị nọ ebe ahụ anaghị achịkọtali ala ha, ndị agha ha na-akpa arụ, ma nwekwa oke ala enweghị mgbochi."" Otu Jihad kachasị akpa ike na mpaghara a bụ nke ha na al-Qaeda na-arụkọ bụ otu Jama'at Nusrat Al-Islam wa'l-Muslimin (JNIM). Otu a nke ha na otu IS na-arụkọ bụ Islamic State in the Greater Sahara (ISGS) achịpụla ya ugoro ugboro n'afọ a. Naijiria Naijiria ahụla nke tọrọ Biati n'ọgụ ndị agha Jihad dịka Gọọmenti na-agbali ibuso ndị Boko Haram agha n' Ọwụwa Anyanwụ Ugwu NAijiria. Ozi si ""Global Terrorism Index,"" kwuru na ""Boko Haram egbuola mmadụ ""37,500 n'agha ebe ihe karịrị mmadụ 19,000 nwụrụ site na nsogbu iyi egwu kemgbe afọ 2011 ọ kachasị na Naijiria"" na mba ndị dị ya nso. N'afọ 2015, otu nkewa dị na Boko Haram sowere IS, were ghọọ ""Islamic State West Africa Province"" (Iswap), ma nweta ụkpụrụ n'ikperemmiri Chad n'afọ 2018. Otu ahụ kwuru na ihe onyonyo nke otu ahụ wepụtara n'abalị mbụ nke Ọnwa Disemba na ọ bụ ha gburu ọtụtụ ndị ọrụugbo na Borno steeti ndị ha kwuru dọnyere ndị agha Naijiria ukwu. Mba ndị ọcha kwenyere inye Naijiri" afirika-44009407,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44009407,Gọọmentị mba Burundi agbachile ụlọọrụ ntaakụkọ BBC,Ụlọọrụ na-achịkọta mgbasa ozi na Burundi bụ NCC n'aha ịchafụ kwuru na ha mechiri ụlọọrụ BBC maka ebubo ị da iwu mgbasa ozi.,"Burundi ga-eme ntuliaka ị dọtị oge onyeisiala ha ga-achị Ha kwuru n'ime akwụkwọ ha depụtara na BBC kpọpụtara otu onye na-akparị ala Burundi n'elu otu ihe emume ha. Ụlọọrụ ntaakụkọ ọzọ ha mechiri bụ Voice of America maka ị gbasa ozi na-atụmatụ iwu ala Burundi machiri amachi. N'ime akwụkwọ ahụ ha dọkwara ụlọọrụ ntakụkọ bụ Radio France International aka na ntị ha kpachara anya maka ụzọ ha sị enyocha akụkọ ha na-agbasi. Nke a na-abịa ebe ọ fọrọ izuụka tupu Burundi eme ntụliaka ị mara ma a ga-adọtị oge onyeisiala Burundi ga-anọ n'ọrụ. Lee akwụkwọ ahụ edepụtara n'asụsụ French: Onyeisi BBC n'Afịrịka bụ Solomon Mugera ekwupụtala okwu gbasara akụkọ a. Mugera sị na mgbachị a adịghị BBC mma n'obi, ọ sị ""gọọmentị Burundi agwala anyị maka otu ajụjụ ọnụ anyị mere n'elu igwe okwu ndị French amasịghị ha"" Ọ sị na ha ga-eme nyocha ma zakwa gọọmentị Burundi aziza maka okwu a nakwa ""o nwee akụkọ anyị mebiri iwu anyi ga-enyocha ya ọfụma"" Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47519205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47519205,Emeka Ihedioha: O meriela ọkwa gọvanọ nke Imo,Inec akpọpụtala aha Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti.,"O meriri ndị nnukwu mmadụ dịka Hope Uzodinma, Ifeanyi Araraume, Uche Nwosu, Ikedi Ohakim nakwa Linus Okorie, iji zọta ya bụ oche. Ihedioha ji vootu 273,404 were merie onye nke abụọ bụ Uche Nwosu zọrọ n'okpuru pati AA, ebe o nwetara vootu 190,364. Onye bụ Emeka Ihedioha? Emeka Ihedioha dị afọ 53 bụ onye ọrụugbo nke ukwu nwekwara ụfọdụ ụlọoriri nakwa ahịa mmanụ agbịdị. Ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu nke nta n'afọ 2003 ịnọchi anya Aboh-Mbaise-Ngor Okpala. O mechara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta site n'afọ 2011 rue afọ 2015 ma bụrụkwa onyeisi ụlọomeiwu nke nta. Ọ malitere ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP dịka o meriri ntụliaka imeụlọ nke ha haziri. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49836445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49836445,Second Niger Bridge: Abụbụ ọrụ ndị na-aru akwa Niger nke abụọ emeela ka ọrụ kwụsị,Onye na-elekọta ọrụ gọọmentị etiti n'Anambra steeti bụ Ajani Adeyemo ekwuola na ọrụ akwụsịla n'akwa mmiri Niger nke abụọ.,"Ọrụ Akwa Naịja nke abụọ ka nọ n'isi mbido Ọ kọwara BBC Igbo n'ekwentị na nke na-eme n'ihi esemokwu dapụtara n'etiti ndị obodo nakwa ndị ji ya bụ ọrụ bụ ụlọọrụ Julius Berger. N'ọnụ ya, ""Julius Berger kwụsịtụrụ ọrụ na ya bụ akwa mmiri n'ihi na ndị ọrụ gbara abụbụ ọrụ"". Iwe ndị obodo Ọ sị na ""ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na aka ndị isi obodo akwa mmiri a metutara dị n'abụbụ ọrụ a"" BBC enwetefụghị ndi obodo ka ha kwuo uche ha, mana Maazị Adeyemo kwuur na ọ bụ maka ebinyeghi aka na nkwekọrịta ha na ụlọ ọrụ na-ese okwu. Akụkọ ọzọ pụtara na-ekwu na ndị obodo ahụ bu iwe n'obi ebe onyeisi ọrụ na ụlọọrụ JB bụ Mr Weiser nọ. Adeyemo kwetara nke a na-ekwu na o nwere nkwekọrịta ebinyebeghị aka na ya nke ndị obodo chere na ọ bụ Weiner na-egbochi ya. ""Ha na-ata Weiner ụta na ọ bụ ọgbatuhie ma kwuo na ọrụ agaghị aga ihu maọbụrụ na ewpụghị ya"" Gọvanọ Anambara etinyela aka Mana ugbua, Gọvanọ na-achị Anambra steeti akpọọla nzụkọ ka-enweike kpee udo n'etiti ndị ahụ niile. Onye ọzọ na-arụ ọrụ n'ime ngalaba na-ahu maka ọrụ na Naịjirịa achọghị ka BBC Igbo kwuo aha ya kwuru na okwunaụka a so na ihe ndị ha na-agabiga n'ọrụ na Naịjirịa. ""Mgbe Babatunde Fashola kwuru na ụfọdụ obodo bụ ọgbatuhie n'ọrụ gọọmentị na-arụ, ọ ụdịrị ihe a ka ọ na-ekwu maka ya"". BBC Igbo gbara mbọ maka ịnụta n'ọnụ Julius Berger mana ha asabeghị ajụjụ anyị zigara ha. Cheta na amalitere ịrụ ọru na Akwa mmiri nke abụọ ga-esi Asaba gafee osimiri Naija ruo Onisha kemgbe mgbe Goodluck Jonathan na-achị. Mana, ọ bụ n'ọchịchị Buhari ka ọrụ bịara kwanye ọkụ ruo ugbua ọkwụsịrị. Ihe nkiri ga-amasị gị 'E ji akwa Naija nke abụọ egwu Ndigbo chandum'" afirika-47684150,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684150,Lassa Fever Outbreak: Mkpamkpa Iba Lasa ataala isi mmadụ anọ,N'ahụike Ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe bụ NCDC ekwuola na ọrịa Iba Lasa ebidola ịkpa mkpamkpa ọzọ.,"N'ime ozi ha ziputere ha kọwara na mmadụ iri abụọ na tọ enwetala ya bụ ọrịa ọhụrụ na steeti gụnyere Ebonyi Imo Enugu Edo na ndị ọzọ. Mmadụ anọ nwụkwara na steeti Edo, Bauchi nakwa Benue site n'ọrịa a. Ụzọ ị ga-eji gbochie ọrịa ịba lasa Na ndọrọndọrọ ọchịchị, Inec enyela elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọcị ụka dịka oge a ga-amalite ngụko vootu na ntuliaka emegharịrị na Kano steeti. Ebe ndị mmadụ na-etimkpu ka akagbuo ya bụ mmegharị ntuliaka n'ihi okwu mwakpo na nsogbu na-arị ibe ya elu. Na mba ofesi, Ndị wụnyụrụ anya n'ajọ ifufe mmiri nke Bekee kpọrọ 'Cyclone Idai' arịala elu. Ka ọ dị ugbua ọ fọrọ obere ihe ka ndị ndụ fụnarịrị rue narị asaa na mba Mozambik, Malawi nakwa Zimbabwe. N'egwuregwu, Ahmed Musa Onye ọgbaa bọolụ Naịjirịa bụ Ahmed Musa ekwela ndị otu Dream Team Naịjirịa otu nde naira kwa goolu ha gbabara n'ime neeti ndị Libya mgbe ha ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Monde. Cheta na Libya ji ọkpụ goolu abụọ merie Dream Team nke Naịjirịa mgbe ha zutere onwe ha na Tunishia. Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-55127268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55127268,Ipob: O nwereike Nnamdi Kanu amaghị maka nchụpụ achụpụrụ Uche Mefor,"Solomon Egbo, ekwuola na Mazi Nnamdi Kanu amaghị maka nchụpụ a chụpụrụ Uche Mefor dịka osote onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' IPOB.","Nnamdi Kanu na Uche Mefor Nke a na-abịa dịka akụkọ ọgbaaghara dapụtara n'ime otu IPOB na-arị elu. BBC Igbo mere mkparịtaụka iji mata ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ. Na mkparịtaụka a, anyị kpọrọ Clifford Iroanya onye sobu n'otu Ipob nakwa Solomon Egbo. Egbo kwuru na ọ bụ ndị nọ na ngalaba DOS nke IPOB wepụtara akwụkwọ na-ekwu na ha achụọla Uche Mefor. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị Nnamdi Kanu nwere ikike ịchụpụ Mefor na Ipob. Egbo gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị nọbu n'isi otu Ipob enweghị obi ọcha gbasara ya bụ otu. O kwuru na ọ bụ ndị ahụ na-awụnye mmiri ọkụ n'okwu dị n'etiti Nnamdi Kanu na Uche Mefor ma na-ebutekwa nkewa n'etiti Ipob. N'aka nke ya Clifford Iroanya kwuru na otu Ipob dịka ọ dị ugbua enweghị usoro ọbụla doro anya ha nwere iji nweta Biafra. O kwuru na Ipob bụ otu enweghi isi nke o ji enwe ọdụ n'ihi na ndị ndu ha enweghị ụzọ ha na-agbaso. Iroanya dụrụ ọdụ ka ndị nọ n'otu Ipob kwụsị ịkparị ndị mmadụ iyi nakwa ịkparị ndị mmadụ ndị ekwenyeghị na ọzịzọ Biafra. Ọ gara n'ihu kwuo na ọkpụrụkpụ ihe ji ọdịmma Naịjirịa bụ akwụkwọ iwu nke a kpọrọ .Constitution' na Bekee. ""Ọ bụrụ na emegharịghị akwụkwọ iwu a, o nweghị ihe ọbụla ga-enwe isi na Naịjirịa.""" afirika-55042352,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55042352,'Etu Nnamdi Kanu si chọọ ịlakọ mụ na Chi m'- Ụkọchukwu Peace,Ọnụ na-ekwuburu Indigenous People of Biafra n'Abuja bụ ụkọchukwu Peace enyela Nnamdi Kanu ga-enyere ya aka chịkọta otu Indigenous People of Biafra na-ekewasị.,"O kwuru na ọ bụ makana Nnamdi Kanu chọrọ ịlakọ ya na chi ya site n'iche ya ndị otu Ipob ndị ọzọ n'arụsị dị n'Arochukwu mere o ji rie mbo mbo ọsọ n'otu ahụ. Mana Peace kwuru na ife arụsị abụghị ihe ya na chi ya kpara. Peace kwuru si na ọ chọghị isonye n'otu na-ekwu na ha na-enweta nwereonwe ma na-akwanye ndị mmadụ n'agbụ nke ọkpụkperechi. O kwuru na ọ bụ n'afọ 2019 ka o kpebiri na ọ ga-apụ n'otu Ipob. Ndụmọdụ ụkọchukwu Peace na-enye Nnamdi Kanu Kanu emezina na ọ bụ ya kacha mara ihe niile. Ya nye ndị ọzọ ohere ka ha weta echiche ọma ha n'iwulite ọdịma otu Ipob. Agbanwela ebumnobi Ipob si n'ikwanye ndị mmadụ n'okpukperechi. Kanu kwụrụ n'eziokwu, ya ejizina aha chukwu atụ asị. Kwe ka ndị ọkammụta maa ka-esi edepụta okwu onye ọchịchị ga-ekwu,dere gị ihe ị ga-ekwu. Kwụtụ obere ụka, ma mee ọtụtụ ihe dị mma. Nye ndị mmadụ ohere iweta alo ọgbara ọhụrụ ga-ewulite otu Ipob. Mana ọkaiwu Ipob bụ Alloy Ejimakor kwuru na o nweghị mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo chee ndị otu ya n'arụsị. Onyeisi ọzọ ọ pụọla n'otu Ipob? Lee ihe anyị ma Akụkọ na-ekwu na Mazi Obidi Obienu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Notu Amerịka apụọla n'otu ahụ. Na soshal midia, ozi anyị ka na-eyocha e depụtara ebe Nnamdi Kanu chụrụ ya bụ nwa amadi na-efegharị. Ozi ahụ BBC Igbo amabeghị ma o si n'aka Obienu kwuru na o nwetara ozi n'aka Nnamdi Kanu kwuru ka ọ kwụsị ọrụ dịka onyeisi Ipob na Notu Amerịka makana o kpọrọ ọgbakọ na-anataghị ndụmọdụ Kanu. Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ Ihe Ipob sara Uche Mefor maka ebubo na ha chụpụrụ ya na redio Biafra O nweghị ihe dị njọ na anapụrụ Mefor igodo redio Biafra- Okaiwu Ipob Alloy Ejimakor bụ ọkaiwu Indigenous People of Biafra ekwuola na Uche Mefor kwesiri ị gee Nnamdi Kanu nti n'ihe ọbụla ọ gwara gbasara redio Biafra makana ọ bụ onyeisi otu Ipob. O kwuru na Mefor chọọ, ya ga mepee redio nke ya makana onye ọbụla nwere ohere ị mee ka o si sọ ya. Lee ihe niile o kwuru n'uju ebe a: 'Etu Nnamdi Kanu si kwapụ m n'ụgbọ redio Biafra'- Uche Mefor Onye kpọrọ onwe ya osote onyeisi Ipob bụ Uche Mefo etiwasala ihe na-esere ya na Nnamdi Kanu. O kwuru na Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu ahụ gbanwere redio Biafra bụ nke ya bụ Mefo so hibee na agwaghị ya agwa. Akụkọ ihe na-esere ha n'uju Mefo kwuru na ndị otu Ipob pụtabụrụ na-ekwu na ọ na-ebi ndụ ihu mma abụọ. ""Ha kwuru na a ga-achụ m n'otu ahụ."" O kwuru Kanu gara n'ihu gwa ndị mmadụ ha nwete Ipob community redio ma hapụ radio Biafra. 'Etu e si gbagbuo ụtọ obi m n'ihu m n'Oyigbo'- Monday Bakor ""Nke a mere ka ndị mmadụ tụwa m aka na ha ma na mụ bụ Uche Mefo nwere ihe ọjọ m bụ n'obi."" O kwuru na Kanu gakwara n'ihu wepụ ụfọdụ ndị na-ekwubu okwu na redio Biafra. Mefor kwuru na Kanu mere nke a na-agwaghị ya. 'Nnamdi Kanu na-arụrụ gọọmenti Naịjirịa ọrụ' - Ralph Uwazuruike N'okwu ya, ""ndị mmadụ na-ajụ m gịnị na-eme, kedụ ihe m ga-aza ha."" Mefo kwuru na mgbe Kanu gwara ya ya nye onye ọzọ akara eji aba radio Biafra , ọ jụru ajụ. Ọ jụrụ ya si kedụ ihe mere iji emepe Ipob community redio, ruo ugbua Kanu azabeghị ajụjụ a. N'okwu ya,"" Nnamdi Kanu akparịala m nke ukwu."" Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere ""E kwuwe okwu mmalite radio Biafra , a ga-akpọpụtarịrị aha m mana taa otu onye nọ otu ebe na-achọ ịkpọm ewu."" O kwuru na kedụ ka Nnamdi Kanu ga-esi na-ekpe ekpere ma na-atụ asị n'elu ihe gbasara okwu redio Biafra. O kwuru na etu ihe si kwụrụ ugbua bụ na o nweghịzị akara e ji aba redio Biafra. O kwuru na aha redio nke ọ na-emepezi ugbua bụ Biafra Human rights redio. Ralph Uwazuruike : Ihe ọ sara Nnamdi Kanu maka ngaghariwe End SARS N'okwu ya, ọ bụrụ na Kanu chọrọ ka ọ kwụsị redio ọhụrụ nke ya , Kanu mara na Ipob community redio ga-akwụsịkwu. Mefo kwuru na okwu nke a senitere isi bụ nke kacha wute ya mere o ji pụta kwupute okwu hoha. Cheta na otetụla a na-anụ kepukepu na Nnamdi Kanu na Uche Mefo na-enwe obere esemokwu mana Mefo apụtala kpọọ okwu aha. Ihe ọkaiwu Ipob sara Uche Mefo Okaiwu Ipob bụ Alloy Ejimako ekwuola na Nnamdi Kanu nwereike ị nara Uche Mefo akara e ji abanye redio Biafra oge ọbụla sọrọ ya makana adịghị adị abụọ abụ eze. Gbasara okwu na Mefo ga-emepe redio nke ya, Ejimako kwuru na Mefo nwekwara ike ịchụwa Biafra n'ụzọ nke ya ma ọ chọọ. Ihe o kwuru n'uju ga-abata na-eteghị aka ugbua." afirika-43657848,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43657848,'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola',Ọrịa Lassa Fever ka na-akpa mkpamkpa na-ala anyi bu Naịjirịa,"Ndị Dokịta chọrọ ka goomenti wakpo ọria Lasa dika ha si mee Ebola. Ka ọ dị taa, ya bụ ọrịa ogbugbu a na-ebutekarị site n'ahụ oke abatala Abia Steeti n'akwa Steeti ndị ọzọ. Otu onye ọrụ ahụike na-ahụ ka ọrịa si agbasasị bi n'Enugwu bụ Chinenye Nwaekpe Kowara ịba lasa dịka ọrịa a na-ebute site n'oke ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ. Ọdọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpuchie ebe ọbụla ha dosara nri ndị dịka garrị, akwụkwọ nri, Breadị, mmanya ndị dị n'iko makana oke ahụ na-ebu ya bụ nje lasa nwere ike ịnyụkwasa ya mamịrị. Nke a nwere ike ibute ọrịa ịba lasa ahụ. Otu ụzọ esi gbochi ọrịa Lassa bu n'ikpuchite ihe mmadụ na-eri eri. Nwaekpe Kwara arịrị na ndị Dọkịnta n'akwa ndị ọru ahụike kachasị ebute ọdachị a n'ihi na ha anaghị akpachapụrụ onwe ha anya ọfụma. Ọ rịọrọ gọọmentị ka ha were aka ahụ ha jịrị merie Ebola wee chakwasa ọrịa Lasa a ọkụ ma chụpụ ya n'ala anyị. Chinenye Nwaekpe bụ onye ọrụ ahụike nke a na-akpọ 'Epidemologist' n'olu bekee, gwara ndị ọchịchị obodo nile ka ha kụọ ekwe wee gwa ndị mmadụ ụzọ mgbochị ọrịa bụ Lassa Fever. Ọrịọrọ ndị ọbụla ka na erị oke ma ọ bụ anụ ọhịa ndị ọzọ ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ. Gere ihe okwuru ebe a n'uju: 'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola' Akụkọ na-ekwu na ọrịa Lasa e nwebeghị ọgwụ eji agwọta ya. Ụzọ mgbochi lasa fiva Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere: 1.Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị 2.Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị 3.Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị 4.Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n'ụlọ ọgwụ 5.Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka 6.Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka 7.Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n'ụlọ gị 8.Ahụ rịa gị, ga n'ụlọ ọgwụ 9.Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile" afirika-47844010,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844010,Man City vs Brighton: Jesus agbatala ọsọ enyemaka,Ufọdụ ndị chebu na Man City ga agbakasị Brighton ahụ mgbe ha zutere ụnyụaahụ mana ụmụ Pep Guardiola ahụghị bọọlụ gbaa.,"Man City bidoro ọfụma ka isi Gabriel Jesus kụbara bọọlụ Kevin de Bruyne nyere ya n'ime goolu Brighton ka a ka nọ n'ime nkeji anọ. Ka nke ahụ mechara, Brighton jidere bọọlụ kpọchie mana ha ya bụ usoro ha wetere enyeghịrị ha aka maka ha ahụghị ohere inye goolu nke ha. Onye na-echere Man City bọọlu bụ Kyle Walker buru isi ya budo n'ihu Alireza Jahanbakhsh nke Brighton nke mere anya onye nchịkọta asọmpị ji chaa manụ manụ, mana enyeghi ya akwụkwọ ọbara ọbara. Mmeri a enyela Man City ohere ịga agba nke ngwụcha nke Iko FA ebe ha ga-ezute Watford maọbụ Wolves n'ubọchị nke 18 nke ọnwa Mee. Nke mekwere ya Iko atọ Man City ka na-achụzi ike n'ọkpọ a. Cheta na ha ritere Carabao Cup, ka nọdụkwa na Premier League nakwa Champions League. Onye isi ya pụtara n'asọmpị a Aymeric Laporte tara akpụ n'asụ na ya bụ asọmpị. Onwere mgbapụ omere n'ọnụ goolu bụ ejecha agbwụ. Ya bụru na-omeghi nke ahụ, agaghị na-ekwu na Man City agafeela. Mana anyi agaghi echefụkwa isi Jesus! Man City ga-ezute Tottenham na Premier League taa. Brighton na Bournemouth ha ezute ụbọchị Satọdee na-abịa n'asọmpi Premier League." afirika-50289214,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50289214,Aba Women's riot: Gịnị ka ị ma mere n'oge a n'afọ 90 gara aga?,Ị ma ihe mere ụmụnwaanyị Aba ji gbara ọtọ were mee ngagharịiwe wuru ewu n'afọ 1929?,"Foto a bụ nke ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe n'obodo Durban, mba Saụt Afrịka n'afọ 1959 Ngagharịiwe a wuru ewu n'akụkụ ụwa niile n'oge ahụ n'ihi na atụwaghị anya na ụmụnwaanyị nwere nkwuwa okwu n'ala Igbo. Gịnị kpatara 'Aba Women Riot'? Foto a abụghị nke ụmụnwaanyị Aba N'afọ 1928, ndị ọcha mba Ịngland na-achị Naịjirịa malitere ịnakọ ụmụnwoke ụtụisi. Ha na-ezipu ndị mmadụ ka ha kpagharịa n'ụlọ n'ụlọ gụkọọ ụmụnwoke. Mana n'afọ 1929, ndị ọchịchị nyere iwu na ụmụnwaanyị nakwa anụ ụlọ ga-eso n'ihe a na-agụkọ iji gbakọọ ụtụisi. Nke a ekweghị ụmụnwanyị odidi chaa chaa n'ihi na ihe siri ike oge ahụ; ha wee foro ntutu taa, gbakọọ ọnụ wee malite ngagharịiwe. Kedụ ndị so mee ya bụ ngagharịiwe? E ji 'Aba Women Riot' mee ejije Nollywood n'afọ 2019 Otu n'ime ndịisi ụmụnwaanyị ahụ so hazie 'Aba Women Riot' bụ nwaanyị a kpọrọ Nwanyeruwa. Dịka akụkọ si kwuo, Nwanyeruwa wụ onye Ngwa mana ebe a lụrụ ya wụ n'Oloko. Ndị ọzọ bụ Ikonnia, Nwannedia na Nwugo. Onye nke ọzọ bụ Mary Okezie nke a sị bụ nwaanyị Ngwa mbụ gụrụ akwụkwọ. Okezie esoghị mee ngagharịiwe ahụ mana ọ bụ ya dere akwụkwọ degara otu e hibere ka ha nyochaa ihe kpatara ya bụ ngagharịiwe. Ngagharịiwe a rukwara obodo dịka Ikot-Abasi nke dị n'Akwa Ibom Steeti. Ngagharịiwe ahụ ọ mịtara mkpụrụ? Ọ bụ eziokwu na ihe karịrị ụmụnwaanyị iri ise nwụrụ na ya bụ ngagharịiwe ka ndị uweojii bịara jiri egbe chụsasịa ha ma gbaa ha egbe, mana ọ mịtara mkpụrụ. O mere ka ndị ọcha na-achị oge ahụ mata na ụmụnwaanyị abụghị ofe nkupu. Ngagharịiwe ahụ mekwara ka otu ụmụnwaanyị siwanye ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile. 'Aba Women Riot' 2019 Ụmụnwaanyị Aba na-eme ngagharịiwe n'ọnwa Ọktoba 2019 N'ọnwa Ọktoba afọ 2019, ọtụtụ ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe n'Aba. Iwe ha bụ maka ajọ ụzọ na enweghị ọrụ nke juputara na steeti Abịa. Ha kwuru na ha chọrọ ime ihe ụmụnwaanyị Aba mere na 1929. Onye sị na anyị anaghị akwụ ndị ọrụ ụgwọ n'Abia steeti tụrụ ashị Mana otu ụmụnwaanyị ọzọ pụtara mekwaa ngagharịiwe n'otu ụbọchị ahụ na-ekwu na ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu dị ha mma n'ahụ. Gọọmentị Abịa kwukwara na ọ bụ ngobi ka e gobiri ụmụnwaanyị ahụ mere ngagharịiwe nke mbụ ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" afirika-53640856,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53640856,"WAEC 2020: Ule Waec nke afọ 2020 amalitela ugbua, lee etu o si aga","Dịka a malitere ule Waec n'ụbọchị 17, nke ọnwa Ọgọst 2020, BBC Igbo gagharịrị Enugwu steeti iji mata ka ụfọdụ ụlọakwụkwọ siri rube isi n'iwu Covid-19.","N'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ụmụnwaanyị nke Trans-Ekulu dị n'Enugwu, ụmụakwụkwọ niile yi mkpuchi imi ma nọsapụ anọsapụ dịka iwu si kwuo. Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ijeoma Okpe, dugharịrị anyị n'ime ụlọ ebe a na-ele ule a, ma gosikwa na onye ọbụla ma ndị nkuzi ma ụmụakwụkwọ, ga-akwọ aka tupu ha abanye ule. Ijeoma Okpe bụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ jikerela ka nwata akwụkwọ Mara na e ji mgbakọ na mwepụ bụ ""Mathematics"" na Bekee, malite ule a n'ụlọakwụkwọ Trans-Ekulu. Ụmụakwụkwọ nọsapụrụ anọsapụ wee na-ele ule ha Ule 'maths' Waec ọ gbapuru? Akụkọ pụtara na akwụkwọ e ji aza ule maths gbara n'ezi, mere ka ọtụtụ ndị kpụrụ ya n'ọnụ ma tinyekwara ụfọdụ nọ na-achọ ya ọkụ ọkụ. Mana ngalaba West African Examination Council (Waec) ekwuola na ọ bụkwa akwụkwọ adịgboroja ka ha hụrụ na-efegharị n'elu soshal midia na ebe ndị ọzọ. Ụlọọrụ Waec nke dị na Naịjirịa gwara BBC na ọ bụ ndị wayo na-ekesa akwụkwọ adịgboroja ndị ahụ, nke ha chọrọ iji gwuru ndị mmadụ ego ha. Demianus Ojijeogu bụ ọnụ na-ekwuchitere Waec na Naịjirịa, kwuru na ọ bụghị eziokwu na e leela ule maths na Ghana dịka kepukepu si ekwu. Ojijeogu kwuru sị ""Ahụrụ m atọ n'ime akwụkwọ ndị ahụ na-efegharị ụnyaahụ, ha niile bụcha adịgboroja. ""Ọ ga-atụ nwata akwụkwọ ọbụla ji ya bata n'ebe a na-ele ule n'anya mgbe ọ ga-ahụ na ọ dị iche na nke ọ ga-ele"". Mara na ihe ruru ndị ụmụakwụkwọ otu nde na ụma malitere ule Waec taa. Lee usoro e si ele Waec nke afọ a Ngalaba na-ahazi ule sekọndịrị bụ Waec n'aha ịchafụ ahazigharịala etu a ga-esi dee ule ahụ ọzọ. Ha wepụtara usoro ọhụrụ a n'ụbọchị asaa nke Ọgọstụ n'akara Twitter ha. Ngalaba na-ahazị ule sekọndịrị bụ Waec n'aha ịchafụ kwuru na ule 'waec' afọ a ga-amalite n'abalị iri na asaa nke 'ọnwa Ọgọstụ rue abalị iri na abụọ nke ọnwa Septemba. Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tuuzde ka ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị na Naịjirịa malitere agụmakwụkwọ ọzọ maka ndị nọ n'afọ ikpeazụ na sekọndịrị. Waec nke afọ a adịghị iche na nke ndị ọzọ - Nwajiuba Lee akwụkwọ niile nakwa ụbọchị ndị ewepụtara a ga-ele ya n'uju ebe a: Ụjọ ji ụmụakwụkwọ maka ule WAEC bịaara ha na mberede BBC Igbo kpagharịrị n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Enugwu Steetị ịmata ka ụmụakwụkwọ ji akwadọ maka ule WAEC na-abịa n'izuụka abụọ n'ihi mmepegharị ụlọakwụkwọ. Ụfọdụ ụlọakwụkwọ BBC Igbo gara gụnyere Trans Ekulu, bụ ebe ụmụakwụkwọ malitere akwụkwọ taa mana ụmụakwụkwọ ebidobeghi ọmụmụ. Ụmụakwụkwọ a kwara arịrị na maka ule WAEC na-achọ ịmalite 17 Ọgọstụ na ha adịghị njikere n'ihi ịnọte aka n'ụlọ na-enwe ezi ọmụmụ ihe. N'ụlọakwụkwọ Geofrey Okoye dịkwa n'Enugwu, agụmaakwụkwọ amalitebeghi kama a sị ha ga-amalite n'ụbọchị 5 ọnwa Ọgọstụ. Ụlọakwụkwọ Urban Sekọndịrị nke ụmụakwụkwọ sị na a kpọkọtara ha ma sị ha lawa bidokwa echi. N'ụlọakwụkwọ Queens, ọ bụ eziokwu na ụlọakwụkwọ emepeela mana ụmụakwụkwọ nọ na-akpagharị n'ezi ụlọakwụkwọ ahụ. Dịka ewepụla mmachị ma nye ikike ka ụlọakwụkwọ bido agụmakwụkwọ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgụst bụ Monde. Iwu a bụ nanị ndị nwere ule ọpụpụ ka gọọmentị nyere ikike ibido. Ndị ntaakụkọ anyị gara n'ụlo akwụkwọ dị iche iche iji hụta etu ya bụ mmepe agụmakwụkwọ si gaa. Ụlọakwụkwọ n'Enugwu ekela nkwụcha maka agụmakwụkwọ ndị nke ọpụpụ. BBC gagharịrị Enugwu iji mata ka ha si dị nkwadebe. Na ụlọ akwụkwọ Trans Ekulu girls sekọndịrị skull, principal ya bụ ụlọ akwụkwọ bụ Oriaku Ijeoma Fidelia Okpe kwuru na ha emechaala nkpocha na nzachi classroom nakwa gburu gburu niile. Okpe gosiri ka o si dọta tanki mmiri nakwa ebe a na-akwọ aka maka ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi. Ọ kọwara na ule ha ga-ebido n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgụst 2020. Ule ndịa gụnyere WAEC, NECO na BECE bụ maka ndị ọgba nke JSS3. Ndị nkuzi na Nike grammer school na Government Technical College Enugwu kwukwara na gọmenti Enugwu emeela""fumigation"" makwa ""decontamination"" n'ụlọ akwụkwọ ha nakwa njikere ndị ọzọ. Anambra Steeti Nnamdi Azikiwe Secondary School Abagana. Onyeisi ụlo akwụkwọ Nnamdi Azikiwe secondary School bụ Fidelis Obalum kwuru na ha adịla njikere ka ụmụakwụkwọ bido agụmakwụkwọ. O kwukwara na ha ehiwechala ma tinye ihe niile gọọmentị nyere dịka usoro iji chekwa ụmụakwụkwọ. Obalum na-atụ anya na ihe dịka n'ime ụbọchị abụọ na ha ga-ebido agụmakwụkwọ." afirika-44550654,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44550654,Lee ụmụnne abụọ na-eji akpụ emepụta ọkụ latrik na Gana,Ụmụnne abụọ nọ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Gana egosila ụwa na ị ga-ejinwu akpụ mepụta ọkụ latrik.,"Kwesi na James na-egosi ihe ha mepụtara nke mere ndị agbataobi ha ji bido ihụ akpụ n'ụzọ pụrụ iche James na Kwesi Ansah mepụtara ihe ha kpọrọ 'JK2 table power' site n'ihe dịka plastiki, osisi nakwa waya si na kọpa. Akpụ bụ ihe oriri a ma ama si na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka, nke ndị mmadụ na-eji emepụta nri dị iche iche. Maka na ndị na-akọ ugbo na-emepụta akpụ karịrị ihe ndị mmadụ na-eri, ọtụtụ akpụ na-emebi. Mana site n'ihe a ụmụnne abụọ a rụpụtara, ndị mmadụ ga-enwe ike iji akpụ mebiri emebi maọbụ ihe a tufuru n'ime akpụ wee mee ka ekwentị gị nweta ọkụ, mee ka ọkụ latrik nwuo nakwa tinye ọkụ na redio na ihe ndị ọzọ. James Ansah na nwanne ya nwoke bụ Kwesi Ansah na-egosi etu ha si eji akpụ emepụta ọkụ latrik James na Kwesi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị maọbụ ndị na abụghị ndị ọrụ gọọmentị kwado ha, na ha ga-enwe ike ịmepụta ọkụ latrik ga-enye ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ime obodo na ndị niile na-enweghị ọkụ latrik na Gana ọkụ. E nweghị ọkụ na-emebiri anyị ihe Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50580508,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50580508,Child marriage: Kedụ aha ole iwu kwuru ka alumdinanwunye na Naijiria?,Onye ọkaiwu ekwuola na o nweghị iwu nwata nwoke dị afọ 17(iri na asaa) lụrụ nwaanyị dara dịka ọ bụ n'ụzọ omenala ka ha mere alụmdịnanwunye ha.,"Soshal midia nwuru ọkụ dịka akụkọ pụtara nke na-ekwu na ụmụaka abụọ lụrụ onwe ha na Nnewi Anambara steeti. Somto Nwachukwu, onye Obiofia Otolo Nnewi mere emume alụmdina wunye dn'ụzọ omenala, ihe dịka otu ọnwa gara aga, dịka ononye achọghị ka a kpọaha ya gwara BC Igbo. "" Amaghị ihe o ji buru ugbua ka ya bụ akụkọ na-ewu. O mere ihe karịrị otu ọnwa gara aga."" N'ala Igbo, a na-alụrụ nwata nwoke a mụụ naani ya nwaanyị n'oge iji gba mbọ hụ na aha ezinaụlọ ya efughị, mana onye mgba ama bụrụkwa onye obi ọhịa kọwara na ọbụghị naanị Somto ka a mụrụ. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nweghị ihe ọjọọ dị ya, ebe ọtụtụ ya bụ ihe adabachaghị n'anya ya. Mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze nke Mahadum Nassarawa StateUniversity gwara BBC na ""O nweghịkwa iwu o megidere."" ""Iwu Children and Young Person Law kwuru na nwa dị afọ iri na asaa etoola ị sị na ọ bụ dịmkpa."" Eze gara n'ihu kọwaa na nke nwaanyị dị afọ 16 ka bụ nwata n'ihu iwu Naijiria. Gee ihe Ọkaiwu Eze kwuru n'uju: O nweghịkwa iwu nwa dị afọ 17 lụọ nwaanyị megidere- Ọkaiwu Child bride: Ụbịam so ebute nsogbu iluchu di ""Akwụkwọ ekweghị Somto agụ nke mere ka ọ kwụsị na JS 2."" ""O bidoro na-agwa ndị mụrụ ya na ọ chọrọ ilu nwaanyị."" ""O kwugidere , ha kwado ya ọ gaa lụta nwaanyị."" Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-44763030,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44763030,Igbo enweghi oke ala maka ịchị ehi - Ndị gọvanọ,Mkpebi dị iche iche pụtara ihe site na mkparịta ụka ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke Naịjirịa mere ụnyaahụ n'Enugwu.,"Mkpebi ndị a gụnyere na steeti ha enweghi oke ala ọbụla maka ihiwe ogbe ebe a na-achị ehi dịka ha kwuru na ha enweghi ala zuruoke maka ọrụ ngo. Nke a dị na-akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Dave Umahi wepụtara n'ime mkparịta ụka ha mere ụnyaahụ. O kwuru na gọọmentị etiti asịbeghi ha wepụta ala maka na ha mara na ala dị na mpaghara a ebughi ibu. Umahi kwuru na ha agaghi amapụta oke ala ọbụla ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti asị ha wepụta ala. Ha rụtụrụ aka n'oke ogbugbu ndị mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa ma kwupụta ụjọ ha nwere na nke a nwereike imetụta steeti ha n'otu ụbọchị. Ha kpọrọ oku ka ha na ndị isi ụlọọrụ nchekwa dị iche iche, ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo nwee mkparịta ụka n'atufughi oge, iji gboo nsogbu ndị a. Ndị ọzọ so na mkparịta ụka a bụ Ohanaeze Ndigbo, Ndị eze ọdịnala, na ndị isi ụlọọrụ dị iche iche. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50690187,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50690187,Everton vs Chelsea: Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba,Ndị otu egwu bọọlụ Everton mere ndị nke Chelsea ihe a na-eme nwata ntị ike.,"Mbo niile Tammy Abraham gbara taa amutaghị mkpụrụ Everton mere ihe a na atụghi anya ya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asatara nani otu merịa ndị otu egwu bọọlụ Chelsea. Mmeri a na atọ ha ụtọ n'ihi na ha enweghị onye nkụzi dịka ha chụrụ Marco Silva n'ụbọchị 7 Desemba 2019. Ọ bụ Duncan Ferguson nọchitere dịka onye nkuzi Everton . Obi bụ ndị Everton pọlịnapọlina dịka ha merrir ndi Chelsea were gbagote na gba nke 14 Everton kpughere ite goolu ha na nkeji nke ise mgbe Richarlson De Andre ji isi were nye goolu were sị ndị Chelsea nnọọ. Chelsea gbaliri ike ha ịsa goolu a mana ndị nchekwa goolu Everton jị odeshi. Na gba nke abụọ ka Dominic Calvert-Lewin mezuru ya abụo dịka eji nkeji anọ banye na gba nke abụọ Chelsea gosikwara na ọ bụ nwoke na ibe ya na-emekọ ihe mgbe Mateo Kovacic zahachiri ha were nye ndị Chelsea olileanya. Kama olieanya ha dara mba mgbe Calvert-Lewin mezuru ya atọ were tịpịa olileanya niile ndị Chelsea nwere. Dịka ichu ndị nkụzi otu egwu boolụ na-ewu na 'Premiership', oge oruola mgbe Lam[ard jị akwara ngwongwo ya? Akụkọ ga-amasị gi" afirika-53701830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53701830,Oliver Ekene Nwosu: Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu maka esemokwu Fada Nwosu na Bishop Awka Diocese,Fada Oliver Ekene Nwosu ekwuola na ọ gaghị ewepụta akwụkwọ nkwụsị ọrụ Catholic Bishop Awka Diocese nyere ya mgbe ọ bụ Deacon.,"Ọnụn na-ekwuchitere Bishop Awka bụ Fada Martin Anusi gwara BBC Igbo na ọ bụ Fada Oliver ga-ekwuli ihe dị n'ime akwụkwọ nkwụsị ọrụ Bishop Paulinus Ezeokafor nyere ya. Mana mbọ nile anyị gbara ka anyị nata ya akwụkwọ ahụ kpụrụ n'ala. N'ọnụ Fada Nwosu, ""ihe mụ na Bishop Ezeokafor zitere m dịka akwụkwọ nkwụsị ọrụ dịrị anyị."" Ọtụtụ mmadụ na-ekwu uche ha gbasara nkwupute Fada Oliver Ekene Nwosu mere maka esemokwu dapụtara n'etiti ya na Bishop Awka Diocese. Ụfọdụ kwetere n'ụfọdụ ihe Fada Nwosu kwuru mana ụfọdụ si na ha ji obere nnu were ihe ndị o kwuru. O nwere ndị na-ekweghị chacha ma na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ ha che na ọ zachaghị ya ọfụma. Etu nghọtahie mụ na Bishop Awka Diocese si malite - Ekene Nwosu N'ọdị nso a ka akụkọ malitere ifesa na soshal midia gbasara otu ụkọchukwu Katọlik a chụpụrụ achụpụ na Naịjirịa. Akụkọ a kwuru na ụkọchukwu a, aha ya bụ Oliver Ekene Nwosu, ji ụzọ aghụghọ wee mee ka e chie ya ụkọchukwu na mba Tanzania. Akwụkwọ ozi si n'aka Dayọsis Morogoro nke mba Tanzania, kwuru na ha akwụsịla Ekene Nwosu ọrụ ya dịka ụkọchukwu, n'ihi na o ji ụzọ aghụghọ nara ha ngọzị. Mana Nwosu gwara BBC Igbo na aka ya dị ọcha n'ebubo e boro ya. Ọ kọwara na ọ bụ Bishop nke Dayọsisi Ọka, aha ya bụ Paulinus Ezeokafor, na-achụgharị ya ma na-ata ya ahụhụ. Gere ihe niile Ekene Nwosu kwuru nakwa ihe ndị Ọka Dayọsisi sara ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa, Chukwunaeme Obiejesi na Nnamdi Agbanelo." 45584500,https://www.bbc.com/igbo/45584500,"""Idemmiri a bụ nke kacha njọ anyị hụrụla nsonso a"" - Osinbajo",Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Nsogbu idemmiri,"Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agaala Anambara na Delta steeti ebe o zutere ndị okeidemmiri chụpụrụ n'ụlọ. End of Twitter post, 1 Osinbajo garuru Otuocha, ebe o kwuru na ""idemmiri a bụ otu n'ime ndị kacha njọ anyị hụrụla nso nso a."" End of Twitter post, 2 Dogara na PDP Ọ bụ eziokwu na Yakubu Dogara agafeela PDP. O kwuru na ọ gara tinye akwụkwọ mmasị ya ịzọ ọchịchị. Na mba ofesi, Anwụchiela ndịagha anọ gbagburu nwata akwụkwọ n'isiobodo Mogadishu dị na mba Somalia. Ndị otu Amnesty International kwuru na mgbọ tụrụ nwata ahụ nọ n'ime ụgbọala bu ya na ụmụakwụkwọ ibe ya ka ndị agha ahụ bidoro gbawa egbe dịka ha na-achọ ụzọ ụgbọala ha ga-esi pụta na kpachikpachi dị n'ụzọ. N'egwuregwu, Amaju Pinnick meriri ntuliaka mere ya onyeisi otu NFF na Naijiria ugbua Ebe Chelsea na PAOK Salonika na-agba egwu onye ike ga-agwụ ugbua, ebe Arsenal na Vorskla Poltava ga-azọ onye ga-emeri ibe ya dịka a na-agba Europa League na mgbede a. Gere nkeji mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Naịjirịa Dịka ntuliaka 2019 na-akpudebe nso, ndị ụka Kraịstị na ndị alakụba ebinyela aka n'otu akwụkwọ udo maka ọdịmma obodo. Akwụkwọ udo ahụ nke otu UN na mba Amerịka so we lekọta bụ iji gosi mkpebi otu abụọ ahụ na agaghị enwe ọgbaghara dịka ntuliaka na-abịa. Kanyị bido N'Enugwu ebe ndị uweojii nwụchiri otu onye ụkọchukwu ndị ụka Metodist n'ebubo n'aka ya dị n'ogbugbu e gburu igwe ndị Ọgbọzinne n'Akpugo bụ Igwe Stephen Nwatu. Cheta na dị mmadụ tigburu Igwe Nwatụ maka esemokwu dị n'etiti ya na ndị obodo ya nke e kwuru n'aka ụkọchukwu Kenneth Okafor dị ya. Ọgbọzinne e derela dun - Ebere Amarizu Akụkọ mba ofesi Onyeisi mba Briten bụ Theresa May ekwuola na ya agaghị ejide Brexit ma oge ya rue. Mba ahụ nwere naanị ọnwa isii iji hapụ otu EU mana enwebeghi nkwekọrịtadị n'etiti ha na ndị EU gbasara ụfọdụ ihe. N'egwuregwu, Taa ka a ga-ama mbe nabọ nke bụ oke dịka ndị na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'aha ịchafụ ga-eme ntuiaka onye ga-abụ onyeisi ha. Ya bụ ntuliaka ga-akpọtụ na Katsina taa ebe onyeisi otu ahụ Amaju Pinnick ga-azọ onye ga-achị ya afọ ọzọ na-abịa. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi" afirika-49931404,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49931404,Tiwa Savage na Charles Anazodo: Ihe ekele ji dị mkpa n'ala Igbo,Charles Anazodo bụ ome ihe onyonyo Nollywood a ma ama bụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua maka ihe o dere na soshal midia.,"Anazodo kwuru na Tiwa Savage enweghi nsọpụrụ n'ihi na ọ keleghị ya mgbe ọ hụrụ ya n'otu ụlọọrụ mgbasaozi. End of Twitter post, 1 Tiwa Savage bụ otiegwu a ma ama sara ya na-ajụ onye ka ọ bụ o jighị ga-ebu ụzọ kelee ya? Ihe a gara n'etiti ha mere anyị ji na-ajụ: Kedụ uru ekele bara n'ala Igbo? Otu onye bụ ọkachamara n'omenala Igbo bụ Ositadinma Amakaeze gwara BBC Igbo ihe niile ekele pụtara. Ekele ọ dị mkpa n'ala Igbo? Ihe mbụ o kwuru bụ na ""ikele mmadụ bụ omenala Igbo, a tụrụ anya na ọ bụ nwata ga-ekele okenye."" O kwuru na ihe ekele dị mkpa n'ihi na ọ bụ ajụjụ ga-enwe asịsị ma nye ohere ịkwu ka ihe siri dịrị gị. ""Ekele bụ ohere ga-ebute mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ"" bụ ihe ọzọ o okwuru Nke a ga-ebute mmekọrịta nke Bekee kpọrọ ""Communion"" n'Igbo niile nakwa n'Afrịka. Ihe ọzọ ekele na-egosi bụ obioma ịnwere ebe mmadụ ibe gị no ""Ọ naghị eme ị makwa onye mbụ dịka onye na-eme mpako,"" ka ọ kọwara. N'okwu Tiwa Savage na Charles Anazodo, ọ kọwara na ndị a ma ama nwere akparamagwa pụrụiche. Ọ sị na ọ bụkwa agwa ahụ nwereike ịme ka Tiwa mee ihe o mere n'abụghị ihe o bu n'uche. Emume Oja n'Enugwu" 45306524,https://www.bbc.com/igbo/45306524,Akụkọ kachasị mkpa taa: Ihe Angela Merkel ga-eji maka ya bịa Naijiria,Onyeisi ndị uweojii adọọla FSARS aka na ntị,"Dịka ka anyị si ekwu okwu SARS, onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris enyeela mkpebi ka otu ọhụrụ akpọrọ Federal Anti-Robbery Squad sepuo aka n'ihe niile nanị gbasara ohi maọbụ nke na-eleba anya na ndị tọrọ ndị mmadụ. O kwuru na ụlọọrụ ya ga-anabata mkpesa onyeọbụla nwere maka ụlọọrụ ọhụrụ a Ngalaba na-azi ntuliaka na Naịjirịa INEC ekwuola na mmadụ kariri nde iri na atọ bụ ndị denyere aha dịka ndị ga-eso na ntuliaka 2019. Cheta kwa na taa ka Imo steeti ga-eme ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti mana parti dịka PDP na APGA ekwuola na ha ga-esepu aka na ntuliaka a makana onweghị onye gwara ha maka ya. Angela Merkel ga-abịa Naịjirịa N'mba ofesi, aka na Germany bụ Angela Merkel ga-abịa njem a'ala atọ n'ime Afrika maka ị nwe mkparịtaụka gbasara ndị mbiambiara. Merkel ga-enwe mkparịta uka na Senegal, Ghana na Nigeria, bidoro n'ụbọchị iri abụọ ni itoolu ruo ụbọchị iri atọ nb'otu n'ime ọnwa a. Eniela Ras Kimono taa Na ngwụcha, taa ka ha ga-eli Ras Kimono na bee nna ya n'Onicha Olone n'ime Delta steeti. Ras Kimono bụ oti egwu reggee nke ama ama nke ọma. Gee akụkọ anyị taa: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye" 48167226,https://www.bbc.com/igbo/48167226,Church of Nigeria: Anyị kwụ Bishop chụrụ ụkọchukwu na-edina onwe ha n'azụ,"Ọnụ na-ekwuru isi ụlọụka ukwu nke Anglican bụ ụkọchukwu Folusho Taiwo ekwuola na ""Church of Nigeria"" kwadoro diocese Arochukwu etu ha si chụọ ụkọchukwu abụọ na-edina onwe ha.","Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na-ejidere ha n'aka ebe ha na-akwaso onwe ha iko na ọ bụ ihe ziri ezi ka a chụọ ha. Ụkọchukwu Taiwo kwuru na ""Church of Nigeria"" akwadoghị nwoke idina nwoke maọbụ nwaanyị idina nwaanyị makana ya bụ agwa na-agbarụ okwukwe ụmụ Chukwu. O kwukwara na ha kwadoro ya bụ akwụkwọ ozi na-agagharị n'elu soshal midia maka ọchụchụ ụkọchukwu abụọ ahụ. Cheta na onye nchịkọta Anglican Diocese dị n'Arochukwu/Ohafia bụ Bishop Johnson Onuoha depụtara n'akwụkwọ ozi na a chụọla ụkọchukwu abụọ na-arụ na diocese ahụ n'ọrụ. Akwụkwọ o zigara ndị ntaakụkọ kpọpụtara aha ụkọchukwu abụọ a. N'akwụkwọ ahụ, Onuoha depụtakwara na ha nwetere ozi na ụkọchukwu abụọ na-edina onwe ha , ha mee nyocha ma chọpụta na ọ bụ eziokwu. O kwuru na nke a mere ka ha napụ ha abụọ asambodo ha ji chie ụkọchukwu ma chụpụ ha n'ọrụ ụka. N'ọnụ ya, ""onye ọ bụla ya ndị a na-emekọ ihe ọ bụla kpachapụ anya makana ha nwerike imetọ aha ụlọụka Anglican"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48177112,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48177112,Anambra state: Ihe mere steeti a ji bụrụ 'ọmalịcha nwaanyị' a kpụ n'ọnụ,Kedụ ihe ndị ị nụrụla Anambara steeti dị mma ya?,"Na ""ha anaghị eji ntị anụ maka ego""? Na ""ha na-agwọ ọgwụ ego""? Na ha nwere ""arụsị Ọkịja""? Nke a nwere ike iso n'akụkọ ndị mmadụ ji chọọ iji ịkatọ steeti ọma a, mana ndị gatụrụla steeti a ga-agwa gị na ha so n'ihe a na-eme na Naịjirịa. Ọ bụrụ na ị gatubeghi Anambara steeti, akụkọ a ga-agwa gị ihe ndị ga-akpalite mmụọ gị ịgaru na steeti ahụ. 1) Ha bụ ndị nrụpụta: Ị na-anụ maka Innocent Chukwuma na-ebukọta ụgbọala na Nnewi? E ji Innoson mara ya na gburugburu Naịjirịa. Innocent Chukwuma Ndị ọzọ dịka Chika Okafor e ji Chicason mara, Stella Okoli bụ onye nwe ""Emzor"", Chika Emenike na-arụpụta nri ""indomie a kpọrọ ""Tummy Tummy"" wdgz. 2) Ude ha na-ede n'ọchịchị: Ị ma na ọ bụ Anambara bụ steeti mbụ nwaanyị chịrị na Naịjirịa? Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ. Kama Etiaba chịrị site n'ụbọchị abụọ nke Nọvemba 2006 ruo Juun 13 nke 2007. Ha gbakwara onye mbụ n'ụzọ ọchịchị ndị ọzọ dịka ịmụta Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala mbụ Naịjirịa nwere site n'afọ 1963 ruo 1966. Anambara mụtakwara Alex Ekwueme bụ osote onyeisiala mbụ Naịjiria nwere. 3) Ha bu njem ụgbọala n'isi: A bịa na ndị na-ebuputa ụgbọala ka ndị mmadụ were mee njem, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ kacha n'isi. A ga-agụ ole ghara ole? Ị nụla maka ""Ekenedilichukwu motors""? Ọ bụ Augustine Ilodibe nwe ya. Chisco? Ọ bụ Chidi Anyaegbu nwe ya. The Young Shall Grow Motors? Ọ bụ Vincent Obianodo nwe ya, GUO, wdgz. Ha niile ndị Anambara, ndị Anambara. 4) Nnukwu emume na-agara ha aka ọfụma: Ndị Anambara na-erite ọnụ ha na ji ọhụrụ; e jikwa ịgba mmọnwụ mara ha. E nwere nke ha na-akpọ ""ịpịa agba"", bụ ebe mmọnwụ abụọ ga-eji ụtalị pịakasịa onwe ha ahụ (nwanne ị na-ele m anya ka m kwuo gịnị?) Emume ha agụpụghị ụmụnwaanyị maọlị; a na-eme emume, ụmụnwaanyị ha na-agba egwu a na-akpọ ""ịtụ nya"" maọbụ ""ịtụ mpete"". Ị nụla maka Ọfala? Ede-Aroh? Ito-ogbo? Idegwu? E jicha ha mara ndị Anambara. 5) Ha bụ ndị ""afịa"": Ị na-ele ihe nkiri Nollywood ebe ha na-akọ maka ""kọntena nọ na high sea"", ọ bụ ndị Anambara ka ha bu n'uche. Ịzụ ahịa na-amasị ha nke ọma, ya mere ha ji nwee ahịa kachasị ibu na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka bụ Main Market nke dị n'ọnịcha. Ị nụla maka Ahịa Ọchanja, Ose, Relief, Mgbuka, Nkwọ Nnewi, Oye Olisa, ahịa ""head bridge"" na ndị ọzọ? Ha bucha ya n'isi. 6) Agụmakwụkwọ na ihe so ya: Ọ bụghịkwa naanị ahịa ka ha ma anya ya, ha makwa nke ekwe kụrụ ma ọ bịa n'agụmakwụkwọ. Ọ bụ ya mere ha ji nwee ọtụtụ ndị e ji eme ọnụ n'agụmakwụkwọ na steeti ahụ. Ị nụla maka Chinua Achebe, Chimamanda Adichie, Philip Emeagwali, Ben Enwonwu, Chike Okoli nakwa ndị ọzọ? Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi ""Nwanne rapụ okwu"" ma ọ bụrụkwa ha, makana ọ bụkwa n'Anambara ka ụmụakwụkwọ buliri iko ""Technovation na mba Amerịka si. Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis 7) Kedụ ndị bu okwu rụrụ arụ a kpọrọ ""slang"" n'isi? A na-ajụ ajụ? Ndị Anambara, ọkachasị ndị ""otu Ọnịcha"" nọ n'ụwa nke ha ebe ọ metụtara ịtụpụta okwu ọhụrụ. Ndị a na-asụ ""ị fụrọ na ị fụrọ"" na ""ịve nke a ịve kwọ"" na-atụpụta okwu ndị dị ka ""gbachaa m ahụ"", ""nwanne e kogo m"", ""ife a sị"", ""nothing mega"", ""ị ma ife a na-arụ"" wdgz. 8) Nri ha bụ ""Igbo bịa lee"": Ofeakwụ ahụ na-amasị gị, ị ma na ọ bụ ndị Anambara buputara ya n'ọgbọ? Ofe onugbu ha bụkwa rie ma rachaa aka gị, ụkwa ha kwanụ? Ha ga-esicha ya tinye ya onugbu, ogiri, azụ ọkpọọ nakwa ihe ndị ọzọ (ngwa agụzịla asọmmiri!) Ha nwekwara ebe nlegharị anya gụnyere Ogbunike Cave, Igboukwu Museum nakwa ebe ndị ọzọ pụrụ iche. Ngwa gwa anyị eziokwu, ọ bụ na ọ naghị agụ gị agụụ ugbua?" 56246785,https://www.bbc.com/igbo/56246785,Food blockade: Ndị ugwu akwụsịla abụbụ ha gbara maka ibubata nri dịka gọọmentị kwetara ịkwụ ha ụgwọ,Otu jikọrọ ndị na-ere ihe nri nakwa anụ na mpaghara Ugwu Naịjirịa akwụsịla abụbụ ọrụ (food blockade) ha gbara nke ha ji kwụsị ibubata ihe oriri nakwa anụ ehi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.,"Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello nọchiri anya gọọmentị etiti n'ọgbakjọ ahụ Ha mere nke a dịka ha na gọọmentị etiti nwechara ọgbakọ n'Abuja n'ụbọchị Wenezde, ebe Gọvanọ Kogi Steeti bụ Yahaya Bello nọchịrị anya gọọmentị etiti. Femi Fani-Kayode, onye bụbu Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, nọkwa n'ọgbakọ ahụ. Ọgbọ anụ tọgbọ chakoo n'Enugwu dịka ndị si mpaghara Ugwu ebute anụ gbara abụbụ ọrụ Muhammad Tahir bụ onyeisi otu a kpọrọ 'Amalgamated Union of Foodstuff and Cattle Dealers of Nigeria' (AUFCDN) kwuru na ha kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara n'ihi na gọọmentị ekwetala ịkwụ ha ụgwọ iti aka n'obi ma kwe nkwa ichekwa ndị otu ha. Tahir kwuru sị: ""Obi dị anyị bụ ndị otu ahịa nri mma, n'ihi na ihe niile anyị chọrọ gọọmentị emeela ya."" Onweghịkwa ihe dị n'ọgbọ ehi ""Gọvamọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello arịọla anyị n'aha gọọmentị etiti, ya mere anyị ji kwe ịkwụsị abụbụ ọrụ a taa (bụ Wenezde Maachị 3)."" ""Gọọmentị kwetara ịkwụ anyị ụgwọ iti aka n'obi, ma wepụkwa ọtụtụ ụtụisi ha na-ana anyị, nke a ga-eme ka anyị na-azụ ahịa anyị nke ọma."" Ndị Ugwu na-ere mkpụrụ osisi ahụkwaghị ihe ha ga-ere Etu nkwụsị mbubata nri si metụta ala Igbo Dịka azụmahịa ndị ugwu na Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo, ndị mmadụ ebidola hụwa ụkọ ma mbuli ọnụahịa ọtụtụ nri di icheiche na mpaghara ala Igbo. Soro anyị na njem ahịa dị icheiche na mpaghara ala Igb ka anyị gosi gị etu ọnụ ahịa ha sị dị N'ahịa dị n'Ọka (Awka, Anambra steeti) Ihe a bụ otu n'ime fly over dị n'Awka, Anambra steeti N'Ọka dị n'Anambra steeti, ndị mmadụ na-azụ ahịa sị na ọnụ nri ndị esi ugwu Naijirịa arịala elu. Onye ntaakụkọ ABS gara n'ahịa ahụ ịme nchọpụta n'ahịa Eke Awka bụ onye hụtara nke a. O kwuru na ma ndị na-azụ ahịa ma ndị na-ere ahịa na-atamụ maka ọnụ ahịa ahụ. Lee ihe ọ chọpụtara n'uju: Anụ adịghịzi adị, nke ọnụ ahịa ndị a hụrụ gbaliri oke elu nke mere ka ndị mmadụ hapụ ịzụ azụ ya. Nkata tomato bubụ N3,000 bụzị N25,000 Nkata ose bụbu N4,000 bụzị N15,000 Ji bụbụ 600 bụzị 800 wdg. Mangoro bubu 50 bụzị 100 ugbua. Cheta na ndị azụmahịa ugwu Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo. Na Legọs steeti Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Gbenga Omotosho agwaala ndị steeti ahụ ha atụla egwu maka ụkọ nri. O kwuru na n'agbanyeghị na gwongoworo bu nrị si ugwu abịa tọrọ n'ụzọ na nrị ga-adịrị ndị Legọs steeti niil. O kwukwara na 'gọọmentị ma anya ihe na-aga ma kwuo na ha agaghị ekwe ya ghọrọ ọgbaghara. Akụkọ si styeei ndị ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ka na-abịa..." afirika-44286614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44286614,Dọọnụ ndị Ipob aka na ntị maka ịnọ n'ụlọ echi - Arewa,Ndị otu Arewa Consultative Forum (ACF) chọrọ ka ndị gọvanọ steeti ndị dị n'ọwụwa-anyanwụ hụ na ndị otu Ipob emeghị 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' ha chọrọ ime echi bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee.,"Ndị na-akwado Ipob chọrọ ịnọdụ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee maka 'ụbọchị ncheta Biafra' Ndị ACF kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ dọọ ndị Ipob aka na ntị maka na ihe ha chọrọ ime adịghị mma maka ndịnotu Naịjirịa. Ha kwuru na ihe kpatara ha ji kwuo okwu a bụ maka na otu ngagharị iwe ndị otu Ipob mere n'afọ gara aga kwụsịrị na ndị omekome ịghasasị ihe niile ma merụọ ndị mmadụ ahụ. ACF kwuru sị na ọ bụ ""ya mere anyị achọghị ka ụdịrị ihe a mee ọzọ."" Ha kwuru sị ""Anyị bụ ndị Arewa Consultive Forum nụrụ maka akwụkwọ ndepụta ndị otu Ipob bụ ndị gọọmentị etiti machiri ma kpọọ 'ndị oyi egwu' n'afọ gara aga, depụtara iji kwuo na Mee 30 nke afọ a bụ ụbọchị 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' iji kwanyere steeti Biafra ugwu nakwa iji cheta ndị a na-asị na ndị ọchịehi gburu n'ime steeti iri abụọ na Naịjirịa."" ""N'ịtụgharị uche banyere ihe merenụ, otu ACF na-akpọku ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ka ha gwa ndị obodo ha ka ha ghara ime ihe ndị ga-emebi ndịnotu anyị nakwa ihe ndị ga-emetụta akụnaụba na ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị na ọwụwa-anyanwụ nakwa Naịjirịa niile."" Ndi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka Ndị ACF rịọkwara ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha chekwara ndụ ndị mmadụ bi na mpaghara Naịjirịa ahụ nakwa akụnaụba ha. Ha kwuru okwu a site n'ọnụ onye odeakwụkwọ ha bụ Alhaji Muhammadu Ibrahim-Biu, ebe ha kelekwara ndị Naịjirịa maka ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43913183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43913183,Ụlọomeiwu abụọ akpọọla Buhari oku,Ihe ga adị n'isi okwu ga-abụ oke ogbugbu mmadụ na-eme na mpaghara Naịjiria karịcha na Benue steeti egbe ndị ọchịehị gburu mmadụ kariri 70 n'ọnwa Jenụwarị.,Ndị ụlọrụ sineti ebidola nyocha ihe Buhari mere Ndị nọ n'isioche n'ụlọ sineti kwuru na ha gha enwe mkparịta ụka tupu ha ekwuo mgbe Buhari ga-abịa zara ọnụ ya maka ogbugbu ndị a. Ọ bụ kwa uche ụfọdụ ndị Sinetọ ka ebido ọnọdụ ọ dị n'ụkọ na Benue steeti jiri ya chekwa ndị mmadụ tupu ahazi cha ihe. Cheta na gọọmentị etiti na ndị agha Naịjiria bidoro atụmatụ a kpọrọ ọsọ nwa mba mana ọ beghị oke ogbugbu ndị a. Onyeisiala Buhari na ndị isi oche ụlọomeiwu abụọ Nke a na-abịa ebe ụlọomeịwụ nke nta na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari adaala iwu nke dị ukwu. Ha kwuru nke a ebe akụkọ pụtara na Buhari wepụrụ ihe kariri nde dọlla narị anọ n'akpa gọọmentị etịtị n'anataghị ụlọọmeiwu dị ịcheịche ikike ị me nke a. Ụlọọrụ sinetị ekwuola na ha ga-ebido ị nyocha okwu a ka ha mara ma Buahri adara iwu ga-eme ka ewepu ya n'ọkwa ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44909825,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44909825,Ịchụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ n'ọrụ ezughi -ICPC,Kọmishọn na-ahụ maka ihe gbasara mpụ na mmehie dị icheiche ekwuola na ha anabataghị ọchụchụ achụrụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ ya na mahadum Obafemi Awolowo.,"OAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule Ha kwuru site n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka agụakwụkwọ ha bụ Mohammed Bade na mahadum ahụ kwesiri ị nyocha ọkammụta Richard Akindele maka akụkọ a. O si ""N'agbanyeghị na mahadum achụọla ya (Akindele) n'ọrụ, anyị na-atụ anya na a ga-eme ya nyocha zuru oke ma kpụpụ ya ụlọịkpe maka nke a"". Ọchụchụ ọkammụta OAU: Ọ bụ ihe kwesịrị- Ụmụnwaanyị 'Onyenkuzi kwadara m n'ule maka na ekweghị m"" Gbalahụ idina onye nkuzi gị n'ụzọ ise a Bade kwuru na ọ dị mkpa iji chekwa ụmụnwaanyị na-agụ akwụkọw na mahadum dị icheiche n'ihi na ụdị omume a buru ibu n'etiti ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ mahadum. Ọkammụta Richard Akindele bụ bu onyenkuzi na mahadum Obafemi Awolowo chọrọ idina nwataakwụkwọ ya tupu ọ gafe ule. OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Achụrụ ọkammuta ahụ n'ọrụ mgbe mahadum ya mere nyocha chọpụta na nwata akwụkọ ahụ gafere ule ya ma jide kwa olu ọkammụta ahụ mgbe ọ na-agwa ya na ọ ga-edina ya." afirika-44872584,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44872584,Dọkịta Bumbum: Ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ?,Dọkịta bekee a ma ama dịka 'Dọkịta Bumbum' agbafuola maka ọgwụ ọgbara otu nwaanyi chọro ka o nwelita otele ya.,"Ụmụnwaayị ụfọdụ na-etinye ihe ike ka ewere chọọ mma 'Dọkịta Bumbum' riri mbọmbọ ọso mgbe ọhụrụ na ọgwụ ya rụfere ọrụ a chọrọ ịrụ were gbuo nwaanyị bịara ka owelitekwuo otele ya. Dọkịta ahụ ezigbo aha ya bụ Dennis Furtado malitere ịrụ ọrụ n' otele ya bụ nwaanyi n'ụlọ ya ebe o bi na Rio de Janeiro mgbe nwaanyị ahụ bụ Lilian Calixto dara n'ọrịa, dịka ndị uweojii na-enyocha ya bụ okwu siri kwuo. Mgbe Furtado huru na ya bụ ụkwa akarịala akị, o buru Calixto gbaga n'ụlọọgwụ ebe ọ nọ kubie. Furtado siri ebe ahụ rie mbọmbọ ọsọ ebe ụlọikpe jiri nye ikike sị chọwa ya jide. Ụgbụa ya bụ ụzụ na akpụ ottele nọzị na-ọsọ. Dọkịta Furtado bụ onye gbara afọ 45 na apụta na onyonyo ndị Brazil ma nweka ndị na-eso ya na instagram ruru 650,000. Lilian Calixto na-arụ ọrụ n'ụlọakụ tupu ọ nwụọ Ọchọmma nwaanyi bụ Calixto bụ nke gbara afọ 46 nụrụ di nke ha abụọ mụtara ụmụ abụọ. Akụkọ kọro na ya bụ nwaanyi na-arụ ọrụ na ụlọakụ dị na Kuiaba bụ ebe osi gawa Brazil maka ime ka ike ya bukwuo ibu bụ ebe ọ nọ zuta ọnwụ ya. Ndị ụlọọgwụ ebutere Calixto bụ Barra D'Or dị na Rio de Janerio si na ha gbara mbọ ịzọpụta ya mana mbo ha enweghị isi. Ugbua ndị uweojii si na-akpụrụla enyi Furtado nwaanyị bụ onye ha na-enyo na aka ya dị na ya. Furtado ji oba ozi soshal media mee onwe ya ọkacha akacha na ime ka ahụ nwaanyi buo ibu ma ọ bụ pekwuo mpe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 43371765,https://www.bbc.com/igbo/43371765,Buhari: Anyị ga-eji mkparịtaụka tọpụta ụmụakwụkwọ 110 a tọrọ,Okwu a pụtara ihe ka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari na odeeakwụkwọ nke steeti nke Amerika bụ Rex Tillerson nwechara nzukọ n'Abuja taa.,"Bụharị: Anyị chọrọ ka agbọlata ụmụ anyị a tọrọ na ndụ N'ọnwa gara aga, ndị Boko Haram wakporo ma tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 110 n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe steeti. Ihe karịrị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị otu narị ka na-efu kemgbe afọ anọ e jiri tọrọ ha n'ụlọakwụkwọ sekọndrị dị na Chibok, Borno steeti. Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Will Ross siri kwuo, ndị ọchịchị Naijiria ma na izipụ ndị agha na ụgbọelu ha chụwa ndị agha jihad ji ụmụaka ahụ ga-enwe ihe ọghọm dị oke egwu. Akụkọ ga-amasị gị: Onyeisialabụ Muhammadu Buhari sịrị na gọọmenti haraa mkparịtaụka kama iji ike ndị agha, na Naijiria na otu mba ndị ọzọ na-ejikọ aka na mgbarịtaụka ga-eme ka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị lọpụta n'aka ndị ji ha na enweghị mmerụahụ ọbụla. Ọ sị: ""Anyị na-agba mbọ ịkpachara anya anyị. Ọ ka mma ka akpọlata ụmụ anyị nwaanyị na ndụ."" Ụdị mkparịtaụka a mịtatụrụ mkpụrụ n'oge gara aga. Eji isi ndị Boko Haram nọ na mkpọrọ gbapụtara ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok. Gọọmenti gọrọ agụgọ na onweghị ụgwọ ha kwụrụ iji mee nke a." egwuregwu-54228870,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-54228870,Chelsea vs Liverpool: E zila Chelsea na ọ bụghị naanị chịngọm na-ere eze,Ndị Liverpool gosiri Chelsea na ha ka ga-akwụnwu ụgwọ isi ha dịka ha meriri ha na Stamford Bridge.,"Liverpool asọghị anya na ha nọ na be Chelsea, wee bie ha aka n'ala ma nara ha pọịntị atọ wee lawa. Goolu abụọ ha ji merie Chelsea si n'ụkwụ Sadio Mane na nkeji 50 nakwa 54. Chelsea tara ahụhụ karịa Job nke akwụkwọ nsọ dịka Liverpool ekweghi ha kute ume ndụ, ọkachasị mgbe a chụpụrụ Andreas Christensen. N'agbanyeghi na Chelsea mefuru nde paụnd narị abụọ iji zụta ndị ọgbabọọlụ ọhụrụ n'afọ ọhụrụ a, ọ zọpụtaghị ha. Ọkachasị etu Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu si wee na-agba ọnyụpa n'ọgbọegwuregwu. Chelsea mechara nweta penariti, mana Jorginho gbanyere ya n'aka Alisson na-echere ndị Liverpool goolu. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Barnsley n'asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị 23 nke ọnwa Septemba, tupu ha ezute West Brom n'ụbọchị 26. Ebe Liverpool ga-ezute Lincoln City n'ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba n'asọmpi Iko Carabao, tupu ha na Arsenal akwata ya n'ụbọchị 28." afirika-50774244,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50774244,UK Election : Ihe mmeri Boris Johnson pụtara n'okwu Brexit?,Onyeisi pati Conservative na mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na ya ga-akwụghachị ndị turu pati ya vootu na ntuliaka e mere iji hopụta pati ga-achị mba ahụ.,"Pati Johnson nyere ndị na-azọsị ha ọchịchị bụ Labour pati mmeri pụrụiche dịka ha meriri ha ma n'ebe a na-ahụ ka ebe ndi kwadoro ha ka. N'okwu Praim Minista Johnson kwuru ka a na-eche ka a kpọọ onye meriri oche abụo fọrọ, ọ sị na mmeri pati ha gosiri na ndị Briten kwụ ya n'azụ n'okwu Brexit. Jeremy Corbyn bụ onyeisi Labour pati n'onwe ya kwenyere na pati Conservatives kurur ha isi aba okpu na ya bu ntuliaka. Ọ sị na ya agaghị abụ onyeisi pati Labour ruo oge a ga-eme ntuliaka ọzọ. Kedu ihe mmeri a pụtara? Jeremy Corbyn sị na ya agaghị anọ n'isi pati Labour ruo ntuliaka ọzọ Okwu akpụ n'ọnụ were banye ntuliaka bụ Brexit. Boris Johnson so n'ime ndị kwadoro atụmatụ Brexit a nke butere ntuliaka eji jụọ ndị mmadụ ma ha achọrọ ịnọ n'EU maọbụ ha chọrọ ipụ. Ntuliaka a emere n'usoro ""referendum"" kpọtụru n'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun afọ 2016. Ka emechara ntuliaka a ndị chọrọ ka Briten pụọ na EU ji pacenti 52 merie ndi chọrọ ka anọdụ nwetere pacenti 48. David Cameron - bụ onye na-achị n'oge ahụ - rituru n'ọkwa nke mere ka Theresa May malite ọchịchị. Theresa May rituru n'ọkwa ka agbajọrọ atụmatụ Brexit ya ugboro atọ Mbo niile Theresa May gbara ịhụ na Brexit mere amịtaghị mkpụrụ nke mere ya onwe ya jiri rituo n'ọkwa. Boris Johnson rigoro n'ọkwa were malite njem Brexit a mana atụmatụ owepụtara adabaghị. Ugbua ọ na-ahụ mmeri onwetere na ntuliaka a dịka ikike ọha nyere ya ị ga n'ihu mee Brexit n'usoro ọ chọrọ. Ọkọrọtọ Briten na nke EU Gịnị bụ Brexit? Brexit bụ atụmatụ mba Briten jiri chọọ ịpụ na mmekọ mba Yurope akpọrọ ""European Union"" (EU). Brexit pụtara - ""British Exit"" - nke bụ ọpụpụ Briten na EU. Confused by Brexit jargon? Reality Check unpacks the basics. Kedu ndị so n'European Union Ọpụpụ n'EU ka eme ka ndị Briten na-eji visa aga Yurope Mba 28 so n'ime EU. Atụmatụ a na-enye ha ohere ịtụ mgbere na mmadụ ịgagharị na mba ọbụla ha chọrọ na-enweghi nsogbu. Mba Briten banyere EU n'afọ 1973 (n'oge ahụ, ama ya ka ""European Economic Community). Yabụrụ na UK pụrụ, ha ga-abụ mba mbụ si EU pụọ." 49779822,https://www.bbc.com/igbo/49779822,Cashless Policy: Eziokwu dị na atụmatụ ọhụrụ a CBN wepụtara,Ọtụtụ mmadụ na egosi mwute gbasara atụtụmatụ ọhụrụ ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' wepụtara nke a kpọrọ 'cashless policy' na Bekee.,"Onyeisi 'CBN' na igwe a ji adọrọ ego bụ 'ATM' Atụmatụ a ga eme ka amịpụ ego dị pasentị abụọ ma ọ bụrụ na mmadụ gaa ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise (N500,000) otu mgbe n'ụlọakụ ya. Onyeisi ụlọọrụ CBN bụ Godwin Emefiele kọwara na atụmatụ a bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ị na-ebugharị ọkpụrụkpụ ego n'aka. Emefiele kwukwara na ọbụ iji mee ka ndị mmadu gbasoo ụzọ isi n'ikuku maọbụ n'akara ịntanetị maọbụ akara ekwentị wee na ezipu maọbụ na-anabata ego. Mana ọtụtụ kwuru na atụmatụ a ga-eme ka ihe isiike rịwanye elu na Naịjiria. Ọtụtụ aghọtachaghị ya bụ atụmatụ, ha amaghịkwanụ etu ọ ga-esi adị ire. 'Cashless policy' ọ bụ ihe ọhụrụ? Ọ bụ mgbe Lamido Sanusi bụ onyeisi CBN ka o wepụtara atụmatụ 'cashless policy' Ụlọọrụ CBN kọwara na ọtụtụ mmadụ ghọtahiere atụmatụ 'cashless policy'. Ha kwukwara na atụmatụ a abụghị ihe ọhụrụ kama na ha chọrọ ka ọ dizie ire nke ọma ugbua. N'eziokwu, onye wepụtara atụmatụ 'cashless policy' bụ Sanusi Lamido Sanusi oge ọ bụ onyeisi CBN. Atụmatụ a malitere n'abalị mbụ nke ọnwa Janụwarị afọ 2012 na steeti Legọs. N'ọnwa Julaị afọ 2013, e bidoro ya na steeti Abịa, Anambara, Kano, Ogun, Rivas nakwa Abuja. N'ọnwa Jụlaị afọ 2014 ka ọ gazuru obodo Naịjiria ọnụ. Otu atụmatụ cashless policy ga-esi rụọ ọrụ Iwu CBN nyere ugbu a bụ na onye chọrọ ịkwụnye maọbụ ịdọrọ ego karịrị puku narị naịra ise n'ụlọ akụ otu mgbe, a ga-amịrị pasentị abụọ. Mana pasentị abụọ ahụ bụ n'elu ego nke mara ama, ọbụghị n'elu puku narị naịra ise ahụ. Iji maa atụ, onye chọrọ ikwụnye N520,000, pasentị abụọ ọ ga-akwụ bụ n'elu N20,000 nke mara ama. Pasentị abụọ 20,000 pụtara narị anọ (400). Ya bụ, a ga-amịpụ narị naịra anọ n'ime N520,000. Nhịahụ ga-adị na atụmatụ a Akwụkwọ ozi CBN na-ekwu maka 'cashless policy'. Ụfọdụ ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnụba na ego ekwuola na atụmatụ a ga ara ahụ. E nwere ndị kwuru na ihe dị otu a nwere ike ịme ka obi lọọ ndị mmadụ mmiri itinye ego ha n'ụlọakụ. Ndị ọzọ kwukwara na ọtụtụ ụzọ e si eji ịntanetị ezipu ego anaghị arụcha ọrụ nke ọma. Ebe ndị ọzọ kwukwara na ego a na-amịpụ n'akara ọbaego ndị mmadụ akarịala. Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru: @DrJoeAbah katọrọ atụmatụ ahụ ma jụọ ndị CBN ma ha che na Naịjirịa ka nọ n'ọchịchị ndị agha. @OgbeniDipo jụrụ ihe kpatara ọ ga-eji kwụchaa ụgwọ dị icheiche maka ego ya dị n'ụlọakụ bịakwa kwụọ ụgwọ ọzọ ma ọ chọọ ịdọrọ ego ahụ Ebee na ebee ka a ga-amalite atụmatụ a? Ka ọ dị ugbu a, atụmatụ cashless policy a ga-adị ire naanị na steeti Abịa, Anambara, Kano, Legọs, Ogun, Rivas nakwa Abuja. N'ọnwa Maach afọ 2020 ka ọ ga-ebiri ọkụ na Naịjirịa niile. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị:" afirika-49380231,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49380231,Enugu International Airport: A ga-emechi ọdụ ụgbọelu Enugwu n'Ọgọst 24,"Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria amaala ọkwa na ha ga-emechi okporoụzọ ugbọelu nke dị na ogige ""Akanu Ibiam International Airport"" Enugwu bido n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgọst.","Akanu Ibiam Airport Enugwu Nke a bụ iji ruzie okporoụzọ ahụ ma tinyekwa ihe ndị ọzọ ga-ewelite ọnọdụ nchekwa n'ogige ụgbọelu a. Amatabeghi izuụka maọbụ onwa ole ọ ga-ewe iji ruzie okporoụzọ ụgbọelu ahụ. Mana Henrietta Yakubu, bụ onye binyere aka n'akwụkwọ ozi nke Faan wepụtara kwuru na a ga-eme ka ọha obodo mata ma oge ruo. FBI Akụkọ na-ekusa na soshal midia Naịjirịa bụ na aka ndị uweojii nzuzo mba Amerịka bụ FBI akparala otu nwa afọ Naịjirịa si na nwata kpaa ego. BBC ka na-eme nnyocha ịmata nke bụ eziokwu mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụrụ eziokwu, o bụkwa agwa ọzọ so emebi aha obodo Naịjirịa. Akụkọ na-abịa. Udo alọghachila na Sudan Na mba ofesi, e nweela nkwekọrịta pụrụ iche n'etiti ndị agha na ndị nkịtị na mba Sudan, nke ga-enye aka maka ịhazi ntụliaka n'obodo ahụ iji mee ka ndị nkịtị lọghachi n'ọchịchị. Onyeisi ndị agha bụ Abdel Fattah Abdelrahman Burhan na onye ndu ndị na-eme ngagharịiwe bụ Ahmed al-Rabie binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta a. Cheta na ọgbaaghara malitere na mba Sudan n'ọnwa Disemba 2018 mgbe ndị mmadụ bidoro ngagharịiwe iji chutuo Omar al-Bashir bụ onye chịrịla obodo ahụ afọ iri atọ. N'ọnwa Eprel afọ a ka ndị agha chụturu Al-Bashir, mana ngagharịiwe malitekwara ọzọ mgbe ndị agha ahụ jụrụ ịhazi ntuliaka ma nyefee ndị nkịtị ọchịchị. Liverpool na Arsenal emeriela Sadio Mane N'egwuregwu, ndị otu egwu bọọlụ Arsenal na Liverpool agụrụla mmeri nke abụọ ha na asọmpị ""English Premier League"" nke afọ a dịka ha dulara otu egwu bọọlụ Burnley nakwa Southampton. Otu egwu abụọ a ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee nweta mmeri n'ụbọchị Satọdee. Alexandre Lacazette na Pierre-Emerick Aubameyang N'asọmpi ndị ọzọ, Bournemouth gbara Aston Villa 2-1, Everton tuuru ugo n'aka ndị Watford site n'ịgba ha 1-0. Norwich mere ihe ịtụnanya mgbe ha gbara Newcastle 3-1, ebe Brighton na West Ham gbara ọnyụpa 1-1. Manchester City na Tottenham na-achịpụ ya ugbua ịmata aka ga-agbaji aka. Okwu dị n'etiti Nigeria na P&ID Ọtụtụ mmadụ kwuru na njem Buharị na Benue abiaghi no oge Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-aga n'ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi ụlọikpe Briten sịrị ha kwụọ ụlọorụ Process and Industrial Development (P&ID) ego dị ijeri dọla itoolu ($9bn). Ọkaiwu gọọmentị bụ Dayo Apata n'ozi ya sị na gọọmentị agwaala ndị ọkaiwu ka ha gbaa akwụkwọ megide ikpe e kpere na Lọndọn. Apata kwuru na nsogbu a bụ nke gọọmentị nọ ugbua ritere n'aka gọọmentị gara aga. Ụlọọrụ P&ID sị na ha na gọomentị etiti nwere nkwekọrịta ịrụrụ ha okporo mmanụ gaasị n'afọ 2010 mana gọọmentị emezughi nkwa nke ha. Na ọ bụ n'ihi nke mere ha ji kpọpụ gọọmentị n'ụlọikpe. Ikpe maka ụgbọmmiri mmanụ Iran Ụlọikpe mba Amerịka enyela ikike ka e jide ụgbọmmiri bu mmanụ ndị mba Ịran n'agbanyeghi na otu ọkaikpe na Gibraltar sị ka a tọhapụ ya. Ụgbọmmiri a kpọrọ Grace 1 bu barelụ mmanụ dị nde abụọ na ọma ka e jidere n'Ọnwa Julaị mgbe e che na ọ na-aga mba Syria na nzuzo. N'egwuregwu Barcelona ewerela njọahịa gbapee asọmpi La Liga nke afọ a dịka Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu merie ha ụnyaahụ. Aritz Aduriz nyere goolu dị egwu iji nye Athletico Bilbao mmeri a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-53510026,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53510026,"Humble Li Orji, nwa ada na-eritere Naịjirịa olaedo n’asọmpị Taekwando","Humble Li Orji, dị afọ 25 ugbua dị afọ 18 oge o ritere nturu ugo mbụ ya na Taekwando.","Kemgbe ahụ o ritela ntụrụugo 30 nke gụnyere ọlaedo atọ n’asọmpị mba ụwa. Na mkparịtaụka, Orji kọrọ maka njem ya na Taekwando nakwa etu ụmụnwaanyị ga-esi amụta itinye uche na ihe ha na-eme. O kwukwara maka ịta ahụ dịka mmadụ iji ya nyere onwe ya ahụ nakwa etu mmadụ ga-eji Taekwando chekwa onwe ya. Ọrji kọwakwara ihe mere ụmụnwaanyị ji akarị ụmụnwoke na Taekwando. Gere akụkọ a n'uju. Onye mere akụkọ a bụ Vining Ogu." afirika-44204107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44204107,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze,"Na mba ofesi, United Arab Emirate sị ndị mba uwa bịawa","Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Ipob chọrọ nwere onye Biafra ebe Ọhaneze ndị Igbo chọrọ ka ahazigharịa Naịjirịa Ndị uweojịị ashụsala otu Ipob ebe ha bịara ị bute ọgbaghara na nzụkọ ndị Ohaneze ndị Igbo mere maka hazigharịa Naịjirịa. Ndị amama n'ala Igbo na ndị mba mmiri bịara ọgbakọ ahụ. Ọkparaeze obodo Dubaị Ndị mba United Arab Emirate emeghela ụzọ be ha sị onye ọbụla jị ịkpeghe ịmeghe ụlọọrụ maọbụ ịzụ ahịa batawa. Ha na enye visa afọ iri zuruezu maka onye ọbụla tozuru ịme nke a. Olisa Metuh dara n'ụlọikpa Abuja n'ụtụtụ a Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi otu PDP bụ Olisa metuh atụbọla n'ụlọikpe Abuja n'ụtụtụa a. A na ebo Metuh ebubo nde narị Naịra anọ nke asị na o bubara mgbe ha na-achị. N'egwuregwu, Alvaro Morata nke spain na-agbara Chelsea N'egwuruegwu, dịka mba Spain họpụtara ndị ga eso asọmpị iko mba uwa nke a afọ a, ọpụtala ihe na Alvaro na akpara Cheslea bọlụ agaghị esọ sọọ mpị ahụ. Nwaamadịa, n'ọba ọzị twitter ya nabatara ọnọdụa na obi ọcha. Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ndi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka" afirika-51655771,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51655771,Coronavirus in Nigeria: Ihe gọoment kwuru maka ọrịa Coronavirus,"Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjiria agwala ọha okwu, ebe ọ na-asị ndị mmadụ dere jụụ n'ihe gbasara mbata ọrịa coronavirus na Naịjirịa.","Ọ gara n'ihu sị na ha ekeela nkwụcha n'ihe gbasara ibuso ọrịa a agha, mana gwa ndị mmadụ ka ha na-edebe onwe ha na gburugburu ha ọcha. Ministri ọrụ ahụike dị n'aka na Naịjirịa ekwuola na ọrịa coronavirus akpọrọ COVID-19 abatala na Naịjirịa. Nke a bụ nke mbụ a hụru ya bụ ọrịa na Naịjirịa kemgbe ọ pụtara na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020. N'okwu ya, onye bu ya bụ ọrịa bụ nwaamadi onye Itali bịara Naịjirịa ụbọchị Monde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị. A chọpụtara ya n'ụlọọgwụ mahadum nkuzi nke dị na Yaba, Legọs. A maara na ya bụ nwoke na arụ ọrụ n'ụlọọrụ Agip. Ha kọwatara na ndị ụlọọrụ ahụike pụrụiche a kwadoro maka ya bụ ọrịa a kpọrọ Multi-sectorial Coronavirus Preparedness Group, abanyelarị ọrụ ozugbo maka igbochi ya bụ ọrịa. N'ọba nzikọrịta ozi Twitter ha, ụlọọrụ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) kwuru na ya bụ onye ọrịa nọ n'ụlọọgwụ na Yaba, Legọs ebe a na-enebara ya anya. Ha gwara ọha na eze sị na obi amapụla ha maka na uche ha dị ya. Cheta na ndị ọrụ na-enyocha nje na Naịjriịa akpọrọ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) ekwubuola na o nweghi ọrịa Coronavirus a kpọrọ COVID-19 batara Naịjirịa. Kemgbe Wenezde ka kepukepu batara na ya bụ ọrịa esorola onye Chaịna bịara Naịjirịa were bata. Ya bụ onye Chaịna nwere ahụọkụ gara ụlọogwụ Reddington dị na Ikeja mgbe ebidoro nyowe ya enyo. Ndị ụlọọgwụ ahụ sị na ya bụ onye Chaịna batara Naịjirịa izuụka asaa gara aga enwebeghị onye o zutere si mba ha bịa kemgbe ahụ. Ha kwuru na o nweghị ọrịa ahụ a hụrụ n'ahụ ya. Ihe NCDC kwuru N'otu aka ahụ, mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Legọs depụtakwara uche ha gbasara ma ọrịa ahụ ọ batara ma ọ bụ ọ bataghị Gịnị bụ coronavirus? Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ. A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya. Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ. Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite. O nwere ọgwụgwọ? Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya. Lee ebe ana-eme nyocha Coronavirus na Naịjirịa Ka ọ dị ugbua, Naịjirịa esonyela n'ihe ruru mba 50 bu ọrịa a ugbua. Na mbaụwa, ihe karịrị mmadụ puku iri asatọ bu ọrịa a n'akụkụ ụwa dị iche iche, ebe ihe ruru mmadụ puku abụọ na narị asatọ anwụọla. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ puku iri atọ na isii bubu ọrịa a agbakeela. Gere olu nwata Naịjiria na-aga akwụkwọ na mba Chaịna ịnụ maka ihe ha na-agabiga n'ihi ọrịa coronavirus: Okwu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ Wuhan dị na Chaịna kwuru maka ọnọdụ ha Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44422954,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422954,Naịjirịa ga-ere akụnaụba ọha iji mezuo ego bọjetị 2018,"Naịjirịa na-ele anya na ọ ga-erete ijeri naira 400 na akụnụba ọha nke ga-enye aka tinye ego na bojeti nke 2019, onyeisi ngalaba na-ahụ maka akụnụba ọha kwuru.","Ngalaba ọkụ latrik so na ndị a ga-etinye n'ahịa Alex Okoh, onyeisi ngalaba ahụ akpọrọ ""Bureau of Public Enterprises"" n'asụsụ bekee, kwuru na gọọmentị ahazịela usoro atụmatụ ha ga-eji ree akụnụba gọọmenti, bụ nke ha jiri bụte ego n'aka ulọakụ mba ụwa. Ego a ha bụtere ga-abanye ibulite nkekọrịta ọkụ latrịk, bụ nke ha sị adịghị eme ọfụma. Na mkparịtaụka Okoh na ụlọ ntaakụkọ Reuters nwere na izuụka gara aga, ọ gwara ha na gọọmentị Naịjirịa nwere atụmatụ ire maọbụ inye ụlọ ọrụ ndị nkịtị ihe dị ka ọgbọ egwuregwu na ụlọ ọkụ latrịk. Ndị Reuters nwere na gọọmentị gwakara ha na achọrọ iresi ọha ụfọdụ oke gọọmentị nwere na ụlọọrụ Nigerian Reinsurance Company n'ọnwa Novemba nke afọ a. N'afọ 2013, Naịjirịa bidoro ire akụnụba ọkụ latrịk ya n'uche na ọ ga-enye aka ime ka me ka ọkụ na-adị karịa ka ọ na-adị na mbụ ma webata ego si mba ofesi, mana onweghị otu n'ime ihe mere. Okoh kwuru na ngalaba ọkụ latrịk so n'ime ngalaba 37 ọha erere eritebeghị uru ekwesiri na ha, mana o kwughi akụnụba ole gọọmentị rere. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Naịjirịa alabatala ego ruru ijere dọla 7.8 site n'ake ndị mba ofesi ji ego achụ ego. Buhari ebinyebeghị aka n'akwụkwọ eji eke ego nke 2018, bụ nke ga-eme ya iwu. Bọjetị Naịjirịa riri elu karịcha kemgbe Buhari batala ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43876261,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43876261,Malaria: Ụzọ asaa ị ga-esi gbalahụ ọnwụ site n'ọgwụanwụ,"Ọgwụanwụ na-egbu anwụnta na-ebute ọrịa ịba mana i were iwe anwụnta hapụ ime etu o kwesiri n'ihe gbasara ịchụ anwụ, ụchịcha na, ahụhụ ndị ọzọ, inwere ike hapụ igbochi ọrịa goro ọnwụ.","Ịgba ọgwụanwụ nwere ike igbu mmadụ ma e meghị ya ọfụma Na nsonso a, Ghana ebe ụmụaka atọ gụnyere ejima dị ọnwa itoolu nwụrụ ka ha kuruchara ọgwụanwụ ndị mụrụ ha gbara n'ụlọ ha. Ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ọha na ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital(LUTH) bụ Dọkịta Ezekiel Oridota kwụrụ na emeghị ọgwụanwụ ka o kwesiri nwere ike ibute nsogbu dị icheiche dịka mgbaka akpụkpọahụ,ụkwara,azụzụ, ọrịa ebe e si eku ume na ọnwụ. Lee ụzọ ise ị ga-esi gbalahụ iji aka gị gbuọ onwe gị ebe n'achụ anwụ: 1. Mara ụdị ọgwụanwụ ị na-ego Ogwụanwụ ndị na-enyekarị nsogbụ na-abụkarị ọgwụ ndị ọrụugbo ji echekwa mkpụrụ ha kọrọ ka ọ ghara ịgba ụtụ. Ebe ụfọdụ bụ ọgwụanwụ gọọmentị mabidoro n'iwu mana ndị mmadụ gara n'ihu were ya egbụ ahụhụ. Dọkịta Oridota dọrọ ndị mmadụ aka na ntị sị""Gba mbọ gụọ ihe e dere n' ahejiri mee ọgwụanwụ ịtupu ịzụ ya."" 2.Zụụ naanị ọgwụanwụ e jiri flawa mebe Dịka Dkta Oridota siri kọwaa, ọgwụanwụ ndị na-egbukarị ndị mmadụ bụ ndị nwere chemịcalụ a kpọrọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate'. Iji ọgwụ ndị ọrụugbo eme ọgwụ anwụnta ekwesighị ekwesị Ọ sị: ""Gbara ọgwụanwụ nwere chemicalụ ndị a na-akpọ 'organophosphosphate' nakwa 'carbamate' n'ihi na ihe ahụ dị n'ime ha mere ka ha na-egbunwu anwụ, ụchịcha na oke nwekwara ike igbụ mmadụ."" 3. Yiri ihe n'aka na ị na-agba ọgwụanwụ Ọgwụanwụ nwere ike ikuba n'ọnụ,n'imi nakwa metụta gị n'ahụ na ị na agba ya. Iji gbochi nke a, Oridota nyere ndụmọdụ ka ị yiri ihe n'aka, n'elu imi nakwa n'arụ gị oge ị na-agba ọgwụanwụ. 4. Nye ohere tupu ịlabanye n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ Nyee ogologo oge iji chere ka ọgwụanwụ kusasịa tupu ịbanye hiee n'ụlọ ị gbara ọgwụanwụ. Oridota dụrụ ọdụ ka, ""Mepe windo gị na ma chee ogologo oge ma ịgbacha ọkwụanwụ tupu ịlaba ụra."" 5. Edowela ihe oriri maọbụ ihe ọṅụṅụ na okpokoro ejibu tinye ọgwụanwụ Ụfọdụ na-asa okpokoro ha ji debe ọgwụanwụ na kemikalụ ndị ọzọ were tinye mmanụ, mmiri na ihe ndị ọzọ a na-etinye n'ọnụ. Oridota kwuru: "" Onwela ndị nwụrụ site n'ime ụdị ihe dị otu a."" 6. Edowela nri, mmiri n'ebe ị na-edewe ọgwụanwụ Oge ụfọdụ ndị mmadụ na hapụ nri na mmiri ha oghere mee ka ọgwụanwụ na hibanye na mmiri na nri a na-eri eri. Oridota kwukwara mkpa ọ dị ikuziri ndịọrụugbo ụzọ ha ga-eji chekwaa ihe ha kọrọ na-ejighị ajọ ọgwụ nwere ibanye na nri. Ịrahụ n'ime akwa mgbochi anwụnta bụ ụzọ kachasị mma igbochi ọrịa ịba 7. Jiri akwa mgbochi anwụta chụọ anwụ Dịka ọkammụta Oridota siri kwuo, "" Irahụ ụra n'ime akwa mgbochi anwụnta bụ ụzọ kachasị mma igbochi ọrịa anwụta."" Gee ihe Dkta Oridota kwuru na bekee: Dọkịta Ezekiel Oridota kọwara ụzọ aga-esi gbalahụ ọnwụịke site n'ọgwụanwụ Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47621639,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47621639,Election tribunal: Kagbuonu ntuliaka ọkwa onyeisala - Atiku,Otu PDP nakwa onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru ha bụ Atiku Abubakar agaala ụlọikpe iji zọọ ọkwa nke ha kwenyere na ha meriri.,"Ha gwara ụlọikpe pụrụiche gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala n'Abuja sị ha kagbuo ma megharịa ntuliaka nke ọkwa onyeisiala e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị. O ji ndị ọkaiwu ukwu ruru iri abụọ na ndị akaebe karịrị narị anọ awụchi n'ụlọikpe. Dịka ọ dị ugbua ụlọikpe enyebeghi ha nzaghachị ma ọ bụ hiwe ụbọchị ikpe a ga-amalite. Ike agwụla m ịchị unu! Nke a bụ ọnọdụ onyeisiala mba Kazakhstan bụ Nursultan Nazarbayev nọ ugbua, ka ọ na-ekwuputa na ọ ga-akwụsị ịchị mba ahụ ka ọ chịchara ha afọ iri atọ. Nazarbayev dị afọ 78 kwuru na Kassym-Jomart Tokayev, bụ onyeisi ụlọomeiwu ha, ga na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ruo mgbe oge ọchịchị ya ga-agwụ n'ọnwa Epreelụ 2020. N'egwuregwu, Eze otiti n'otu Super Falcons bụ Asisat Oshoala, ekwuola na ihe ka ya mkpa ugbua bụ ịhụ na ọ gbakere ọfụma ma lọghachịta n'egwu ọ hụrụ n'anya. O kwuru nke a maka akwara ọ dọrọ oge ya na ndị otu Barcelona ya na ndị Atletico Madrid zutere ụbọchị ụka. Ndị agha azaghachila Inec Ndị agha Naijiria Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ọ bụ ihe ịtụrụ ha n'anya banyere ebubo Inec boro ha na ha so mebie ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas steeti. N'ime akụkwọ ozi ha biputara, ha kwukwara na obi adịghị ha mma gbasara ebubo a n'agbanyeghi mbọ niile ha gbara iji nye Inec aka na ntuliaka ahụ. N'ofesi, Obodo Utrecht ebe ọdachi a mere Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ ise ndị ọzọ ahụ n'obodo Utrecht nke mba Netherlands. Amambeghi ihe ọ bụ n'uche mana e chere na Gokmen Tanis na ndị oyi ndụ egwu na-arụkọ ọrụ. N'egwuregwu, Otu bọọlụ Naịjirịa ndị obere ga-ebido ọzụzụ ha na mba Tunisia taa dịka ha na akwado ịzute mba Libya iji mara onye tozuru asọmpị iko mba Afrịka nke obere. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Governorship election: Anyị akwụchala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu" afirika-44934494,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934494,Ọpụpụ ndị omeiwu: 'Anyị kwụ chịm' - APC,"N'ime akwụkwọ ozi onye odeeakwụkwọ mgbasa ozi otu APC bu Bolaji Abdullahi depụtara, o kwuru na otu ha kwụ si ike.","O kwuru na n'izuụka ole na ole gara ka ha na-agbaghrị ị hazi ihe gbasara ndị bu iwe n'etiti ha n'ụzọ dị mma. Mana ọpụpụ ọtụtụ mmadụ mere taa gosiri na ndị ahụ pụrụ apụ bu ihe ọzọ n'uche eso ha. N'ọnụ ya ""Nsọpụrụ anyị nwere n'ebe ndị Naịjirịa nọ mere n'anyị ga-aga n'ihu ị hazi pati anyị na ntuliaka nke 2019 n'abịa"" Cheta na elekere ole na ole gara na onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwupụtara na ndị omeiwu ruru mmadụ 15 ahapụla APC. Saraki gụpụtara akwụkwọ ij maa ọkwa ahụ n'ụlọomeiwu, taa bụ Tuusde, Julaị 24. Ka nke a na-eme, n'ụlọomeiwu nke nta (House of Representatives), ihe karịrị mmadụ 33 hapụkwara otu APC gafee PDP, ebe mmadụ anọ banyere ADC. Ndị PDP na aṅụrị n'ime ụlọomeiwu mgbe ndị APC gafere n'otu ha Ndị omeiwu gafere PDP gụnyere Dino Melaye, Rabiu Kwankwaso na Usman Nafida. Lee aha ndị sinatọ pụrụ n'APC dịka ụlọọrụ sineeti si depụta ya n'Twitter. Ebe Abdul-aziz Nyako na Monsurat gafere otu ADC. Ọpụpụ ndị a mere ka ndị otu PDP bụrụ pati kacha n'ụlọomeiwu ukwu. Ugbua, ndị omeiwu si PDP dịzị 64 ebe ndị nke APC dị 45. Ka ọ dị ugbua, ndị otu PDP nọ n'ụlọomeiwu na-enwe ọṅụ maka ihe a mere. Ndị hapụrụ APC n'ụloomeiwu nke nta gụnyere Danburam Nuhu, Mark Gbilah, Razak Atunwa, Ahmed Garba Bichi, Abdulsamad Dasuk na Zakari Mohammed. Ndị ọzọ bụ Sani Rano, Barry Mpigi, Ali madaki, Dickson Tackighir nakwa Hassan Saleh. Cheta n'ụtụtụ, anyị wetaara unu akụkọ na ndị EFCC wakporo ma gbochie ụlọ Saraki na osote ya bụ Ike Ekweremadu. Mgbe BBC na Yusuph Olaniyonu bụ ọnụ na-ekwuchitere Saraki kpara n'ekwentị, o kwuru na ọ maghị ebe Saraki nọ, mana e mechara hụ Saraki n'ụlọomeiwu ebe ọ nọ kwuputa ngafe ya na ụfọdụ ndị omeiwu ndị ọzọ. Nke a sotere ọtụtụ ozi BBC zigara ekwenti ha mgbe akụkọ gbasara mkpochi ụzọ a pụtara ihe. Onye enyemaka ya bụ Banks Omishore, tinyere na Twitter na ha ji ụgbọala ha nyachie ya ịpụ n'ezi. Echefula na ndị uweojii kpọrọ Saraki oku ịza ọnụ ya maka etu ohi e zuru n'Offa si metụta ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47106806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47106806,Ntuliaka 2019: Ndịagha si na ha na-eche Ipob na ntụlịaka a,Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ ọchịagha Tukur Buratai enyela iwu ka echechie ndị Ipob dịka a na-akwado ntuliaka na nsonso a.,"Buratai kwuru na dịka ọ dị ugbua, ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-agba izu imeụlọ ịhụ na ntuliaka 2019 gara nke ọma. Nke a mere eji mepụta atụmatụ a kpọrọ ""Operation Safe Conduct"" na Bekee. N'okwu Onnoghen, Justice Walter Onnoghen Ụlọikpe na-ahụ maka omume kwụọtọ bụ CCT n'aha ịchafụ adọtiala ikpe onye bụbu ọkaịkpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka Onnoghen n'onwe pụta ịzara ọnụ ya n'ụbọchị iri n'atọ nke febụwarị tupu ikpe ya agaa ihu. Gụọ ya n'uju ebe a: CCT adọtịala ikpe Walter Onnoghen ọzọ Otu APC na Rivas Ụlọikpe mkpegharị emela mkpebi ọhụrụ banyere arịrịọ otu pati APC nke Rivas steeti rịọrọ maka ikpe kagburu ntuliaka imeụlọ ha. Ikpe ahụ nke ụlọikpe ukwu wepụtara nyere INEC iwu iwepụ aha APC na ndị ga-azọ ọkwa ọbụla na steeti ahụ. Na mba ofesi, Na mba ofesi ụfọdụ ndị mmadụ na mba Malawi apụtala ịkwado otu ụkọchukwu akpọrọ Shepherd Bushiri n'ụlọikpe taa. A kpụpụrụ Bushiri na nwunye ya ụlọikpe ịzara ọnụ ha maka ebubo nrụrụaka ego onyinye Akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile 'ụtụtụ Onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati APC n'Ebonyi steeti bụ Sonni Ogbuoji ekwuola ihe mere ojighi bịa ndọrịtaụka BBC Igbo haziri maka ndị na-azọ oche gọvanọ n'Ebonyi steeti. Ogbuoji sị na ọ bụ nsogbu emume ahụ ga-etinye ndụ ya mere o ji gbahapụ ya. Onye mgbasa ozi Ogbuoji bụ Ikenna Omeiwu gwara BBC na ndọrịtaụka ga-abịa gafee mana ndụ ya ka ya mkpa. Omeiwu zitere BBC ozi na Ogbuoji nwereike ị nọ na nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na o so mee ndọrịtaụka ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na gọvanọ Umahi na-eme ka ndụ lara ndị si pati ọzọ azọ oche gọvanọ ahụ. N'okwu ya, gọvanọ Umahi wepụtara iwu ga-akwado ka aghara itinye foto achụmta vootu na steeti ahụ mana ọ bụ sọ pati ya bụ PDP na-etinye nke ha."" BBC Igbo gbara mbọ ịnweta onye otu Accord pati bụ Nnaji Igbokwe ka o kwuo ihe mere ihe ojighị bịa zara ọnụ ya ndọrịta ụka a mana ọzaghị ekwenti ya. Ọzọ, Gọọmenti etiti ezigala ndị nyocha ka ha chọpụta ihe kpatara ụgbọelu Osote onyeisiala Yemi Osinbajo ji daa na Kogi steeti. Osinbajo kelere Chukwu na ụlọụka etu o si napụta ya ma kwukwa na ọ bụ ekpere Onyeisi nchuaja Redeem bụ Enoch Adeboye zọrọ ya. N'Egwuregwu A chọtala ụfọdụ akụkụ ụgbọelu bụ onye otu egwuregwu bọọlụ Cardiff akpọrọ Emiliano Sala na mmiri kewara mba England na France. E bidoro chọwa ụgbọelu Piper Malibu N264DB kamgbe ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị ka Sala na ọkwọ ụgbọelu David Ibbotson nọ n'ime ya. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Onye meriri ọrịa kansa" afirika-46474883,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46474883,Action Alliance: Ọ bụ Uche Nwosu ka anyị ma - Obidiche,"N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara onye ọkaiwu Kenneth Obidiche, o kwuru na ọ bụ ya bụ ezigbo onyeisioche pati Action Alliance (AA) na ọ bụghị Tunde Anifowose-Kelani.","Nke a bụ na nzaghachị okwu pụtara n'ihe akwụkwọ akụkọ na Tunde Anifowose-Kelani ajụla ịnabata Uche Nwosu dịka onye ji aha AA azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti. O kwuru na Anifowose-Kelani ji ọkwa ahụ site n'afọ 2013 rue 2017, mana ọ na-apụrụ ya ọkwa n'ọnwa Apurelu mgbe ha mechara ọgbakọ pati ha. Obidiche kwuru na ọ bụ aha nke ya dị n'akwụkwọ ụlọọrụ INEC dịka onyeisioche pati Action Alliance. Obidiche kwuru na ọ bụ Uche Nwosu bụ onye pati AA nabatara iji aha ya azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti. Okwu Uche Nwosu N'okwu ya; ""Ọnọdụ m dịka onyeisioche Action Alliance dịka okwute zayọn, onweghi onye na-akwa ya aka."" Mgbe BBC Igbo kpọrọ FCC Jones bụ onye odeakwụkwọ mgbasa ozi Uche Nwosu, o kwuru na Anifowose-Kelani abụghị onyeisioche pati AA kama na ọ bụ Kenneth Obidiche. Jones kwuru na Anifowose-Kelani ji aha onyeisioche na-eduhie ndị mmadụ. Na ọ bụ ndị na-emegide Uche Nwosu na-akpa nkata ọjọọ ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na onweghi nkewa ọbụla dị n'etiti Action Alliance, na ọ bụ ndị na-atụ ụjọ na Uche Nwosu ga-emeri n'Imo Steeti na-ekwu nke ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45255831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45255831,Ụlọikpe akpọchiela ụmụnwaanyị Ipob 114 n'ụlọ mkpọrọ,Ụlọikpe dị n'owerri nke ọkaikpe S.K Kadurumba nọ n'isi ya enyela iwu ka akpọchie ụmụnwaanyị Ipob n'ụlọ mkpọrọ rue abalị atọ nke ọnwa Seputemba.,"Ụmụnwaanyị Biafra n'emume ncheta ụbọchị Biafra Ndị uweojii nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a na fraịde gara aga mgbe ha na-eme ngagharị iwe n'Owerri. Ndị uweojii Imo Steeti kpọpụrụ ụmụnwaanyị ndị a n'ụlọikpe n'ebubo ịgba izu nkata megide iwu na-achị Naịjirịa. N'ikpe ya, ọkaikpe S.K Kadurumba kwuru na onweghi ikikere ịtọhapụ ha n'ebubo eboro ha ma nye iwu ka-akpọchie ha n'ụlọikpe rue mgbe a ga-azagharị ọnụ ha ọzọ n'abalị atọ n'ọnwa Seputemba. N'ozi Ọkaiwu ndị Ipob bụ Ifeanyi Ejiofor zitere BBC Igbo, o kwuru na ha bịara ịgbapụta ụmụnwaanyị Ipob n'ụlọ mkpọrọ ka ha si n'ụlọ na-abịa ikpe. O kwuru na ọkaikpe a wepụrụ ebubo nke metụtara Ipob ị bụ otu akagburu akagbu na Naịjirịa site n'arụmaụka o mere banyere nke a. O kwuru na ha ga-eburu ikpe a ga n'ụloikpe ukwu nke dị n'Imo steeti bụ nke nwere ikike ilebanye n'ebubo ndị dị aṅya e boro ụmụnwaanyị a. Ejiofor gara n'ihu jụọ ajụjụ si kedụ etu gọọmenti ga-eji kwuo na ndị agadi nwaanyị na-atụmatụ i chutu gọọmentị na-achị Naịjirịa? O kwuru na ndị nne a na-egosipụta ikike na ugwu ruru ha n'inwe ọgbakọ dị ka ngalaba iri anọ (Section 40) nke iwu Naịjirịa kwadoro ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55112852,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55112852,Ụlọọgwụ ABSUTH n'Aba tọgbọ chakoo dịka gọọmentị ji ndịọrụ ahụike n'Abia ụgwọ ọnwa 18,"Nchọpụta BBC mere gosiri na ụlọọgwụ mahadum Abia steeti, a kpọrọ 'Abia State Teaching Hospital' tọgbọ chakoo n'ihi abụbụ ọrụ ndịọrụ ahụike.","Otu jikọrọ ndịọrụ ahụike a kpọrọ ""Joint Health Workers Union"" (JOHESU) malitere abụbụ ọrụ n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba. Iwe ha bụ maka ụgwọọnwa ọnwa iri na asatọ (18 months) nke gọọmentị steeti ahụ ji ha, nakwa akwụghị ụgwọ ezumike nka nke ndị otu ha lara ezumike. Ha kwukwara na gọọmentị Abia steeti wepụrụ ndịọrụ ahụike n'atụmatụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ha wepụtara. Ihe na-ewe ndịọrụ ahụike Abịa steeti iwe Oge BBC Igbo gara Absuth, anyị chọpụtara na elu na ala tọgbọ chakoo ka ebe a gbara ọsọ agha. Naanị ndịọrụ nọ ebe ahụ bụ ndị nche olemole, nakwa ụfọdụ ndị ha na onyeisi ụlọọgwụ ahụ na-arụkọ ọrụ. Naanị ndịọrụ BBC hụrụ n'ụlọọgwụ ABSUTH bụ ndị nche olemole Mana onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịta Offia Awa Ukonye gwara BBC na ndị dọkịta agbaghị abụbụ ọrụ, kama ọ bụ sọ ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ. Dkt Ukonye kwukwara na onweghị ihe naanị ndị dọkịta nwere ike imenwu ma ọ bụrụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ anọghị ya inyere ha aka. O kwuru sị: ""Oge abụbụ ọrụ ndị Johesu malitere, anyị hapụrụ ndị niile nọ n'ụlọọgwụ ka ha laa"". Okporoụzọ Ahia Nkwo-ABSUTH jọgburu onwe ya na njọ Ukonye kwukwara na ndị isi ụlọọgwụ Absuth nakwa Gọvanọ Okezie Ikpeazu na-enwe ọgbakọ kwa mgbe kwa mgbe iji weta ọnọdụ ahụ n'isi njedebe. ""Gọvanọ ekwetala ịkwụ ndịọrụ ahụ ụgwọ ọnwa isii ruo ọnwa itoolu,"" Ukonye kwuru. BBC chọpụtakwara na okporo ụzọ e si aga ụlọọgwụ ahụ jọgburu onwe ya na njọ. N'ime ogige ụlọọgwụ Absuth dịka ebe a gbara ọsọ Ihu ọnụụzọ ama (gate) Absuth a na-arụ ọhụrụ Ihe gọọmentị kwuru Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu N'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Nọvemba, ka gọọmentị Abia steeti kwuru na ha ehibela kọmiti ga-eleba anya n'ụgwọọnwa niile gọọmentị ji ụfọdụ ndịọrụ steeti ahụ. Ndịọrụ gọọmentị ji ụgwọ gụnyere: N'akwụkwọ ozi si n'aka Onyebuchi Ememanka, bụ onyeisi mgbasa ozi Gọvanọ Ikpeazu, kọmiti a nwere izuụka abụọ iji rụọ ọrụ ha ma wetara gọvanọ mkpebi ha. Mana ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha enweghị ntụkwasị obi n'ebe kọmiti ahụ nọ, n'ihi na ndị niile so na ya bụkwa ndị gọvanọ Ikpeazụ họrọ n'ọrụ. Ndị mebere kọmiti a gụnyere:" afirika-50991659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50991659,Cardi B na 'Door of Return': Ọkụ na-erezi na soshal midia maka atụmatụ ịlọta Naịjirịa,"Ọ bụ Fraịde ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị 2020, ka oti egwu ama ama bụ Cardi B gbarụrụ ihu makana onyeisiala mba ya bụ Donald Trump nyere ndịagha ya ikike ka ha gbuo ọchịagha Qasem Soleimani.","Cardi B bịara Naịjirịa iku egwu n'ọnwa Disemba 2019 Cardi B sị na ya bụ ihe ga-eme ka nchekwa ndị Amerịka ghara ịdị etu o si kwesị, were dee na ya ga-amalite ịgba mbọ inweta akwụkwọ ọ ga-eji bụrụ onye Naịjirịa. End of Twitter post, 1 Sị na ya na-ahọtapọta agbụrụ ọ ga-esi na ya. Ma kegharịa foto ndị mmadụ ji ihe e ji arụgharị foto nke a kpọrọ 'Photoshop' hazie, ime ka ya na nwa ya nwaanyị bụ Kulture, yiri ịchafụ ka ndị Naịjirịa. Nke a tọrọ ụmụ Naịjirịa iche, ma mee ka ụfọdụ sị na o gosiri na ọ bụ Naịjrịa meriri na ndọrọndọrọ onye ka, bụ ihe ha na mba Ghana na-adọ kemgbe. Mana e nwere ndị ya bụ ihe atọghi ọchị, n'agbanyeghị na o bụ egwuregwu ka Cardi B na-egwu. Dịka Maazị Segalink gbarụrụ ezigbote ihu maka atụmatụ Cardi B ahụ. Ka nke a na-ewu, akụkọ pụtara na Naịjirịa na-ewepụta atụmatụ a kpọrọ ""Door of Return"" bụ nke a ga-eji nabata ndị mmadụ dị ka Cardi B bụ 'ụmụ ndị erere ka ohu n'Amerịka oge gboo'. Nke bụ eziokwu bụ na mba Ghana ka mechara emume ha kpọrọ ""Year of Return"" nke ha jikwa nabata ndị chọrọ isi ofesi lọta ala e si kpụpụ nna maọbụ nne ha mgbe gboo. Ya mere aha Naịjirịa jiri wusiwe ike na Twitter dịka ndị Ghana malitere ime akaja si na Naịjirịa na-ama etu esi eme ka ha mere (ijije ha). Mana okwu ""Door of Return"", ahụ BBC ka na-eme nyocha ịmata nke bụ eziokwu. Ka ọ kwụ ugbua, onwebeghi ọnụ na-ekwuru gọọmentị Naịjirịa maọbụ ngalaba gọọmentị sị na ya bụ atụmatu bụ eziokwu. Akwụkwọ mgbasaozi banyere atumatụ a BBC Igbo nwetere ebughi akara maọbu aha onye ọbụla maọbụ ngalaba gọọmentị ọbụla. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ" media-49418612,https://www.bbc.com/igbo/media-49418612,South East Governors: 'Anyị ga-akpụlata Nnamdi Kanụ ma ndị Ipob metụ onye ọchịchị ala Igbo ọzọ aka',Otu jikọtara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ga-akpụlata Nnamdị Kanụ ala Naịjiria ka e kpee ya ikpe ma ọ bụrụ na ndị otu ya bụ Ipob metụ onye ọchịchị ala Igbo ọzọ aka.,"Otu ahụ kwupụtara nke a site n'akwụkwọ ozi nke onyeisi ha bụ gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti wepụtara ụbọchị Tuzde. Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha Umahi kwuru na mba Kanu bara gbasara ịwakpo ndị gọvanọ ma ha bịa mba ofesi bụ mkpọtụ nkịti ka nwa amadị ahụ na-eme. "" Anyị na-adọ aka na ntị na onye Ọwụwa Anyanwụ ọzọ a wakporo ebe ọbụla n'ụwa niile, anyị ka akpụlata Nnamdị Kanu ka ndị mmadụ ṅaa ntị ya n'ọkụ. ""Ọ bụ ara na onye chọrọ ọchịchị na enweghị ihe ọ ma maka ya na-eche na anyị a bụ ndị gọvanọ ga-akwado ogbugbu ndị ndị be anyị maọbụ were ala ezughị ezu nyefee ndị ọchịehi."" Ha gakwara n'ihu ma kwuo na ọ bụụ na Kanu ji obi ya niile ekwu ihe ọ na-ekwu ya buru agha bugara ndị ọchiehi ogbu ọchụ na mba 100 o kwuru na Ipob gbanyere mgbọrọgwụ. N'aka nke ọzọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ rịọkwara onyeisiala Muhammadu Buharị ka ọ gbatịkwuo oge e nyere tupu e mechie ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam nke dị n'Enugwu. Ha kwuru na nke a ga-enye ha ohere ịwepụta atụmatụ ndị ọzọ ga-enyere ndị njem ụgbọelu aka na mpaghara ahụ. N'akwụkwọ ozi ha zipụtara ụnyaahụ, ndị gọvanọ ahụ chọkwara ka a machie ndị ọchịehi ịkpụ ehi na-akpagharị n'okirikiri ala Igbo. Ha kwuru na nke ahụ na-akpata nsogbu nakwa ọgbaaghara n'obodo. Ndị mịnịsta ga-ebido ọrụ taa Ụfọdụ ndị mịnịsta ọhụrụ. Taa ka a ga-edu ndị mịnịsta onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara n'iyi ọrụ ma kwuputakwa ngalaba gọọmentị ha ga na-elekọta. Nke a na-abịa dịka ndị mịnịsta ọhụrụ a nwechara ntụgharị uche abalị abụọ ebe a nọrọ kụziere ha usoro nakwa etu e si arụ ọrụ na gọọmentị. Na mmechi ntụgharị uche ha n'Aso Rock Abuja ụnyaahụ, Buhari dọrọ ndị mịnịsta ahụ aka na ntị ka ha tinye uchu n'ọrụ ha iji mee ka ndị dịwanyere ụmụ Naịjiria mfe. Ọ gwakwara ha ka ha ghara ịkpa iche n'ọrụ ha n'ihi na gidigidi bụ ugwu eze. Kadịnal ga-aga mkpọrọ Kadịnal George Pell nwere ike ịnọgide na mkpọrọ ruo afọ 2022 N'ofesi, ụlọikpe mkpesa na mba Australia ekwuola na ikpe a mara George Pell, onye ji ọkwa ""Cardịnal"" n'ụka Katọlik, maka imetọ ụmụntakịrị nwoke abụọ n'afọ 1996, bụ ihe ziri ezi. E boro Pell ebubo na o metọrọ ụmụntakịrị ahụ n'afọ 1996 nakwa 1997. Ụlọikpe nta mara ya ikpe n'ọnwa Maach afọ a ma tụọ ya mkpọrọ afọ isii, mana Pell gbaghara mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpesa. Ọkaikpe atọ nyochara ya bụ ikpe, abụọ n'ime ha wee kweta na ikpe mara Pell n'eziokwu. Nke a pụtara na Pell ga anọ n'ụlọ mkpọrọ afọ isii ma ọ bụrụ na ụlọikpe ukwu nke Australia kwado ikpe a mara ya. Egwuregwu bọọlụ ụkwụ n'Ijipt N'egwuregwu, otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa e hiwela otu gbata gbata ga-enye aka hazie egwuregwu bọọlụ na mba Egypt ruo afọ 2020. Cheta na ndị isi otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ n'obodo ahụ bụ Egypt Footbal Association gbara arụkwahịm n'ọnwa gara aga oge e dulara ha n'ike n'asọmpi iko mba Afrịka. Buhari eduola ndị minista iyi ọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola ndị minista ọhụrụ n'iyi ọrụ ma tinye ha na ngalaba ha na-achịkọta. Ụmụafọ Igbo dịka Uche Ogah nwetara ọkwa Minista steeti na-ahụ maka Nlekọta ngwuputa ihe dị n'ala, Sharon Ikeazor nwetara Minista steeti na-ahụ maka gburugburu, Emeka Nwajiuba nwetara Minista steeti na-ahụ maka Agụmakwụkwọ so n'ime ha. Gụọ ya n'uju ebe a: Ogah, Ikeazor na Nwajiuba ketara ngwupụta ihe dị n' ala, gburugburu nakwa agụmakwụkwọ Ebe Chris Ngige, Ogbonnaya Onu, na Geoffery Onyeama ka ji ọkwa ha jibu mbụ. Ndị uweojii anwụchiela ndị otu ha anọ Ndị uweojii a bụ ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ Ndị uweojii Legọs steeti anwụchiela ndị otu ha anọ maka igbu mmadụ abụọ ha jidere maka ebubo ohi ekwentị dịka ihe nkiri fegharịrị na soshal midia. Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ihe ndị uweojii ahụ mere megidere iwu ndị uweojii gbasara etu e kwesịrị isi lekọta ndị a nwụchiri a na-enyocha maka ihe ọbụla. Ndị uweojii kwuru na ndị otu ha ahụ bụ Ịnspektọ Fabiyi Omomayara, Sajentị Olaniyi Solomon, Sajentị Solomon Sunday na Kọpọral Aliyu Mukaila, na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Iba. Cheta na nso nso a ndị ọha mmadụ na-eti mkpu maka etu ndị uweojii si egbu ndị mmadụ na eleghị anya n'azụ. N'ofesi, Mba Amerịka etinyela iwu ọhụrụ ga-ahụ na ndị mbịarambịara na-ejighi akwụkwọ bata nwereike ịnọgide na nnwụchi, taa nchara. N'egwuregwu, Franck Ribery dị afọ iri atọ na isii ka na-akpa ike na bọolụ dịka o sonyere ndị otu egwuregwu Fiorentina n'efu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Osita Amakaeze: Ndị ntorobia chọrọ ndị ndu ga-ezi ha ụzọ ọma" afirika-50835634,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835634,"Orji Uzor Kalu, Dino Melaye, Deiziani Allison-Madueke na dị ọzọ dara ọrịa mgbe akpụpụrụ ha n'ụlọikpe maka nrụrụaka",Dịka Oji Uzor Kalu tinyere akwụkwọ ka enye ya ohere ka ọ gaa ụlọọgwụ maka na ahụ esighi ya ike.,"Ka ụlọikpe tọbara Kalu na mkpọrọ, ihe ọzọ a nụrụ bụ na ọ na-ayọ ka ụlọikpe tọhapụnụ ya ka ọ gaa ụlọọgwụ leta onwe ya. Nke a abụghị ihe ọhụrụ na ntị ụfọdụ ndị Naijirịa, ihe kpatara ya bụ na enweela ụfọdụ ndị gọọmetị akpọpụrụ ụloikpe natara ohere maka ọrịa igbanahu ikpe dịrị ha. Lee ndị ọzọ ji maka ahụ esighi ike gbanahu ikpe dịrị ha: Diezani Alison-Madueke Akụkọ ikpeazụ ndị Naịjirịa nụrụ maka oriakụ Alison-Madueke bụ na ọ na-arịa ọrịa kansa. Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi Diezani bụ onye bubu Minista na-ahu maka mmanụ agbịdị na gọmenti etiti site afọ 2017 na 2015. Mana n'afọ 2015, ọtụtụ ebubo nrụrụ aka pụtara n'isi Deziani. Gọọmentị Naịjirịa kpachiri ego ruru ijeri 7.6b nke a na-ebo na ọ bụ ego Diezani. Dino Melaye Dino Melaye ji akwa ọrịa wuchie ụloikpe Dino Melaye bubu onye Omeiwu ukwu nọchitere anya 'Kogi West' n'ụlọ omeiwu site n'afọ 2015 ruo 2019. A kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo na o ji egbe na ngwa agha ụfọdụ. Lee etu ọ dị mgbe awuchịrị ya: Okaikpe ya bụ Mike Ozekhome gwara ụloikpe na site na ikike dịrị onwe, na Dino Melaye kwesiri ka enye ya ohere ịkwu ụgwọ mgbapụta ka ọ gaa leta onwe ya anya. Ụlọikpe nyere ya ikike ka ọ gaa leta onwe ya. Abdulrasheed Maina ji oche nkwọgharị bịa n'ụlọikpe Abdulrasheed Maina onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahu maka ụgwọ ndị ezumike nka bụ 'Pension Reform Task Team' wuchiri n'ụlọikpe n'oche nkwọgharị ka e boro ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra abụo na ndị ọzọ. Olisa Metuh bịara ụlọikpe n'akwa a na-ebugharị E ji akwa mbugharị buru Olisa Metuh bata n'ụlọikpe n'ụbọchị ikpe ya. Olisa Metuh bụbụ onye odee akwụkwọ mgbasa ozi ndị PDP, o nwekwara mgbe ọ dara n'ụlọikpe n'ụlọikpe n'Abuja. Gọọmentị kpụgara Metuh ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya banyere nde naira anọ ha sị metụtara ego onye bụbụ onye ndụmọdụ Naịjirịa maka nchekwa bụ Sambo Dasuki . Bello Haliru Mohammed Bello Mohammed wuchiri ụlọikpe n'oche nkwagharị Oche nkwọgharị ka e jiri buru Bello Haliru Mohammed bata n'ụlọikpe. Maazị Mohammed rụburu ọrụ dịka minista na-ahụ maka nchekwa obodo. Gọọmentị Naịjirịa kpọpụruụ ya n'ụlọikpe maka nrụrụaka. Akụkọ ga-amasị gị: Ụdịrị Biafra ndi Igbo kwesiri ịnwe olilanya ya - Tony One Week Gee akụkọ Nkeji : Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47106803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47106803,Pre-wedding Photo: O nwere ihe dị njọ n'atụmaatụ a?,"Ọ bụrụ na ịnụbeghị maọbụ ịhụbeghị atụmaatụ akpọrọ 'pre-wedding' foto, ị mara na ị so na ndị agbara ochie.","Ụfọdụ na-eri nsusu, ụfọdụ anọdụ n'ụlọ mposi, ụfọdụ a na-emetu onwe ha aka n'ahụ maọbụ gbara ọtọ na Pre-wedding foto anyị na-ahụ ugbua. Akụkọ pụtara na mba Ghana n'oge gara aga kwuru na otu ụlọụka ọgbara ọhụrụ machiri ""Pre-wedding"" foto maka etu ọtụtụ ndị chọrọ ịlụ onwe ha si emetu onwe ha aka. End of Twitter post, 1 Nke a bụ Pre-wedding e mere n'ime mmiri. Mana o nwere ihe dị njọ na Pre-wedding foto? Onye na-ese foto aha ya bụ Otto Udofia gwara BBC Igbo na o nweghị ihe dị njọ na ya bu atụmatụ makana ha na-eji ya egosipụta akaọrụ ndị osee foto. Mana ụkọchukwu Samson Nzekwe kwuru na foto a na-ese tupu agba enweghị ihe ọjọ dị na ya ma ọ bụrụ na nwoke emeela ego n'isi nwata nwagbọghọ ahụ ọ chọrọ ịlụ. Kama ọ nyere ndụmọdụ na ịpịkasị aka n'ahụ ha ma esewe ya bụ foto adịchaghị mma makana ụfọdụ ndị okwukwe ha esighị ike nwereike ịghọtahie ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56674416,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56674416,Mbieri Police Attack: Ndị wakporo obodo anyị bụ ndị be anyị si n'ụlọmkpọrọ Owere gbaa ọsọ - PG Mbieri,"Onyeisioche ọgbakọ obodo Mbieri bụ Adolphus Nnadi, ekwuola na ọ bụ ụmụokorobịa obodo ha si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owere gbaa ọsọ, wakporo ụlọ ndị uweojii dị n'obodo ha n'ụbọchị Wenezde.","Ụmụ okorobịa karịrị iri abụọ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mbieri, gbaa ha egbe ma mebisia ụfọdụ ihe. Adolphus Nnadi kọwara na ndị mere ihe ahụ bụ ụmụ obodo ha na-enyebu ha nsogbu ma na-ere ọgwụike dị icheiche, mana ndị obodo gbakọrọ aka buso ha agha, nwuchie ha, ma nyefeee ha n'aka ndị uweojii nke mere e ji tinye ha na nga. Mana oge ha si n'ụlọ nga gbapụta, ha lọghachiri Mbieri wee ṅụọ iyi na ha ga-abọ ọbọ ihe ndị obodo mere ha. Nnadi gara n'ihu kwuo na obi dị ya ụtọ etu ndị uweojii si kwụdosie ike ma chụọ ndị ntorobịa ahụ ọsọ. Adolphus Nnadi sị na ọ bụ ya ji ọkwa praịm mịnịsta n'obodo Mbieri Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ eze ọdịnala Mbieri bụ Eze Madumere, ọ katọrọ ya bụ ihe merenụ ma kwuo na Mbieri bụ obodo e ji udo mara. N'aka nke ha, ndị uweojii n'Imo steetị kwuru na mmadụ abụo ndị otu ha merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo. Ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwukwar na otu onye uweojii na-efu efu site na mwakpo a, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC na nke ahụ abụghị eziokwu. Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti Ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi N'akụkọ yiri ibe ya, ndị o ji egbe gara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo Ugbodo di n'Okpuru Ọchịchị Ebonyi nke dị n'Ebonyi Steeti. Ndi uweojii kwuru na otu onye ojiegbe nwụrụ na mwakpo ahụ ebe otu onye uweojii merụrụ ahụ. Mwakpo ndị a na-abịa dịka oke mwakpo na-eme n'ebe dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anywụ Naịjirịa. Mwakpo a mere n'Abalị Tusde. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah mana ọ zaghị ekwentị ya. Onye ntaakụkọ ya na BBC na-arụ ọrụ na steeti ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ihe a mere ma kwukwa na a gwara ha na ọ bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii gburugburu bụ Frank Mba ga-etinye ọnụ n'ihe a mere dịrị. BBC Igbo kpọtụụrụ Frank Mba, o wee kwuo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu." 46777298,https://www.bbc.com/igbo/46777298,Ịgụ-Arọ Enugwu-Ukwu: Igwe Ralph Ekpeh ekwuola na udo ka mma,Obu Umunri dị na be Igwe Enugwu-Ukwu bụ nke puku kwụrụ puku mmadụ gbakọtara ịgba aka ebe n'Ịgụ-Aro nke 61 Igwe Ralph Obumneme Ekpeh na-eme.,"Mmemme Ịgụ-Arọ bụ mgbe Igwe Enugwu-Ukwu ji akpọkọba ndị ọ na-achị ọnụ, kpee ekpere wee malite ịgụ afọ ọhụrụ. Igwe Ralph Ekpeh dụrụ ndị niile ochiri echichi ndụmọdụ ka ha bụrụ ndị udo ebe ọbụla ha nọ ma marakwa na Enugwu-Ukwu kwọchara aka were họta onye ọbụla echiri echichi na mmemme Ịgụ-Aro ahụ. Ịgụ-Arọ Enugwu-Ukwu nke 2019 bụ ọpụrụiche Dịka osi kpọtụọ n'obu ụmụ nrị nke afọ a, Igwe Ekpeh chiri ụmụ Enugwu-Ukwu atọ nakwa mmadụ abụọ sị mba ọzọ na Naijiria echichi. Mmadụ abụọ echiri echichi bụ Pius Okafor na Ikechukwu Agana kwuru na obị juru ha afọ na Enugwu-Ukwu chetara ha kwanyere ha ugwu dị etu a. Ndị ọzọ echiri echichi bụ Nze Uche Nworah, Philip Obiora Nworji na Benedict Nweke Nwokolo. Lee etu o si kpọtụọ na foto: Ndị isi bịara ya bụ emume Ndị mmadụ juputara The Experience 13: Ndị egwu Igbo anọ so eme ka o nwuru ọkụ Nwaanyị e chiri echichi Igwe mmadụ pụtara na mmemme ahụ Calabar Carnival: Ka o siri kpọtụọ na mmemme Ekeresimesi Nze Uche Nworah na nwunye ya bụ Uchechi ka echiri ha Ezeudo Enugwu-Ukwu na Umunri na Ugomba Enugwu-Ukwu Mmanwụ dị iche iche dịka: Ene, Police, Ijelle, Ọvụvụ nakwa mmanwụ ndị Bayelsa Steeti bịakwara na ya bụ mmemme. Mmanwụ dị icheiche pụtakwara na ya bụ mmemme Mmanwụ ndị Enugwu-Ukwu Ndị egwu dị iche iche, otu Ọgbọ, ndị ntorobịa, ndị enyị na ikwu na ibe zukọrọ na Obu-Umunri Enugwu-Ukwu wee na-enwe aṅụrị na-afọ ọhụrụ ebidola. E chiri Pius Okafor Ezenwa Enugwu-Ukwu Ikwu na ibe zukọrọ Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị." afirika-55915230,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55915230,Jeff Bezos: Ihe mere o ji pụọ dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon,Onye bidoro ụlọọrụ Amazon ma bụrụkwa onye nke abụọ kacha nwee ego n'ụwa niile bụ Jeff Bezos ekwụọla na ọ ga-arịtu dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon ma bụrụzịa onye na-achịkọta ndị isi ọrụ ụlọọrụ ahụ.,"Nkọwa ya bụ na nke a ga-enyere ya aka ịtinye uchu n'ihe ndị ọzọ dị ya n'obi. O kwuru sị, ""Nke a ga-enye m ohere itinye anya n'atụmatụ ọhụrụ ụlọọrụ Amazon ma nye kwa m ike itinye uchu n'ihe ndị ọzọ na-amasị m. Anaghị m ala ezumike nka, ike ga dị m karịa"". Dịka Bezos kwuru na ọ ga-arịtụ dịka onyeisi ụlọọrụ, lee ihe ọzọ ọ ga-eme : N'Akwụkwọ mgbasa ozi Bezos degara ndị ụlọọrụ Amazon niile ka o kwuru na ọ ga-etinye ịgba mbọ ya n'atụmatụ Day One Fund o bidoro n'afọ 2018 ma kewapụta ijeri dọla abụọ ịkwalite agụm akwụkwọ. O kwukwara na ya ga-ebido atụmatụ Bezos Earth Fund iji kwalite mbara ezi na eluigwe nke ọ wepụtara ijeri dọla iri. Ọ ga-eji ya bụ atụmatụ kwado ndị okammụta na eme nycoha ma na-agba kwa mbọ ịkwalite mbara ezi na eligwe. Bezos nwekwara ụlọọrụ Blue Origin nke na-akwado iji ụgbọelu pụrụ iche ezipụ ndị mmadụ mbara igwe. Bezos kwukwara na ọ ga-etinye uchu n'ụlọ ntaakụkọ Washington Post nke ọ zụtara nde dọla narị abụọ na iri ise n'afọ 2013. Onye bụ Jeff Bezos? Jeff Bezos onye gbara afọ iri ise na asaa bụ onye bidoro ụlọorụ Amazon nke na-ere ihe n'ịtaneti n'afọ 1994 n'ebe ụgbọala na anọ n'ụlọ. Ụlọọrụ Frobes ekwuola na ọnụego Jeff Bewzos bụ ijer dọla otu narị na iri itolu na isii na ụma anọ. Tupu ya na nwunye ya agbasaa, ha mụrụ ụmụ anọ." afirika-56554333,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56554333,Unknown Gunmen in South-East: A wakpoghi ụlọakụ ọbụla n'Ogbunike - Ndị uweojii Anambara steeti,"Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na enweghi mwakpo ọbụla e mere n'ụlọakụ dị n'Ogbunike, n'okpuruọchịchị Oyi, n'ụbọchị Tọzde, Epreelụ 15, 2021.","Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na e nwere ọgbaghara n'ahịa Oye Olisa dị nso ụlọakụ, mana ndị oji egbe ahụ abanyeghi na ya bụ ụlọakụ. Ikenga Tochukwu Anipr bụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na mgbọ egbe ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ nọ na-agbali elu aghara aghara, tụrụ ụmụakwụkwọ abụọ nọ n'ime keke napep na-agafe. Ka o si kwuo, e bugara ụmụakwụkwọ ahụ ụlọọgwụ, ebe dọkịta nọ kwuo na ha anwụọla. Monday Bala Kuryas bụ kọmishọna uweojii na steeti ahụ tiri ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ aka n'obi, ma kwuo na ha na-ama imi n'ala ịchọta ndị omekome a bụ ndị gbakwara ụgbọala abụọ ọkụ ebe ha na-agba ọsọ. Lee ụfọdụ 'unknown gunmen' na-egbu ndị nchekwa - Ndị Uweojii Ndị uweojii anwụchiela mmadụ iri na isii ha sị bụ ndị oji egbe na-egbusi ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa karịsịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba wepụtara site n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ha sị na a nwụchiri ndị a site n'ọtụtụ nnyocha na isi imi n'ala nke si n'enyemaka ndịagha Naịjirịa nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ. Ndị ha nwụchiri gụnyere Ugochukwu Samuel (Biggy) dị afọ 38 bụ onye Arochukwu, Abia Steetị; Raphael Idang dị afọ 31 bụ onye Odukpani, Cross River. Cletus Nwachukwu Egole dị afọ 60, bụ onye Orlu, Imo Steeti; Michael Uba dị afọ 33 bụ onye Imo Steetị na mmadụ 12 ndị ọzọ. Ha sị na nnyocha gosiri na aka Ugochukwu Samuel na Raphael Idang dị n'ogbugbu ndị uweojii abụọ n'ụzọr Orlu-Ihiala n'ụbọchị 24 Disemba, 2020 ma gbaa ụgbọala ndị uweojii ọkụ. Ndị uweojii sị na Cletus Nwachukwu Egole bụ ụkọchukwu n'ụlọụka Holy Blessed Trinity Sabbath dị n'Orlu ebe Michael Uba bụ onye amụma ndị okpukpere Jew; na ha nyere ndị oji egbe a nchekwa n'ụlọụka ha. Ha kwukwara na ndị oji egbe a nọ n'ụlọ Cletus Nwachukwu Egole kpaa nkata ọtụtụ nwakpo ha mere; nakwa Egole ji ala nwanne ya mere ebe ọzụzụ ndị oji egbe a. Ndị uweojii sị na ihe a natara ndị a gụnyere; egbe AK47 dị 10, egbe ndị ọzọ dị 5, mkpo mgbọ egbe dị 17, mgbọ egbe dị 549, ogbunigwe 10, uweojii ndịagha, ekwentị nzirita ozi na ihe ndị ọzọ. Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu ekwusiela ika na ha agaghị anabata mwakpo ndị ọrụ nchekwa n'ụzọ ọbụla. O kwuru na oge na-adịghị anya na aka ga-akparacha mmadụ niile na-awakpo ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa. Adamu dụkwara ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha jikọlata ụmụ ha n'isonye n'ụzọ ime ihe ọjọọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ndị ọjọọ egbuola nwa m bara Uweojii ka onyere mụ aka - Nne Miracle Nwobodo" 42971170,https://www.bbc.com/igbo/42971170,SpaceX nke Elon Musk agbapụla ụgbụelụigwe ọzọ,Elon Musk bụ onye mgbere ama ama ba ụwa niile agbapụla ụgbụelụigwe ya ọ kpọrọ Falcon Heavy.,"Ụgbọala Elon Musk ga na efegharị na elụịgwe ebị ebị. Falcon Heavy si Kenedy Sports Centre and Florida dị na mba Amerịka hepụ jewe Mars. Nnụkwụte ụgbọelụ a - nke kachasị ike kemgbe ebidoro mmepụte ihe a na-akpọ ""shuttle system"" n'asụsụ Bekee - si ebe akwụbala ya hepụ. Elon Musk sị na ya ji obi ya aka mgbe ụgbọelụ a na efepu maka ọ ma na o nwere ike gba ka ogbunigwe. ""A hụrụ ka ọ gbawara na ụche m, mana onweghị ihe ojo mere,"" Elon Musk kwuru. Maka nhepụ oma mere, Falcon Heavy na ahazizi ị bụ ụgbọ a ga ejị na ebụ ụgbọelụ ndị ọzọ na-aga elụigwe. Musk na ekwu na ụgbọelụ ha kariri rocketị bụbụ nke kachasị ike bu Delta IV Heavy ike ụgboro abụọ, agbanyeghi na ọ ka ya daa ọnụ. Ụgbọala Musk na ihe akpịraakpị yiri ya dị na ime ụgbọelu a na eje Mars. Rocket bu ụgbọelụigwe a laghachiri ebe ha si pụọ." afirika-46316035,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46316035,Igbo Taboos: Ihe ise Ala na ndị Igbo na-asọ,"N'oge gboo, Igbo nwere ọtụtụ omume bụ arụ nwereike ibute ọnwụ ngwa ngwa maọbụrụ na mmadụ mee ya.","Ruo ugbua igbu mmadụ bụ arụ n'ala ọbụla Chiagozie Nnabuihe bụ ọkachamara na Mahadum Legọs n'ihe gbasara akwụkwọ gbasara Afrịka nke a kpọrọ African studies na Bekee, kọwara na ọ bụ mmụọ bi n'ime ala bụ ihe na-asọ arụ ndị a. Onye bụ mmọ Ala Omenala kọwara na mmụọ Ala bụ nwaanyị. A gafesie Chi-ukwu, ala bụ mmụọ kachasị mkpa n'ala Igbo. N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ala nwere ike imesu onye ọbụla kpasuru ya iwe. Ọ bụkwa mmụọ a, na-ahụ na ihe niile a kọrọ n'ugbo mịrị mkpụrụ, na-ahụ na mmiri dị n'ala oge ọbụla. Gịnị bụ ihe ise Igbo na mmụọ Ala na-asọ? Igbu mmadụ Onye ọbụla gburu mmadụ ga-eji isi ya buru njọ a Ala na-asọ ọbara mmadụ. Nnabuihe kọwara n'Igbo nwere nkwenye na Ala bụ nne na-enye ndụ. Ya mere ka ọ bụrụ iwu na ọ nweghi onye ga-egbu mmadụ makana onye ahụ agaghị enwe ike inye ndụ. Ntaramahụhụ onye ọbụla gburu mmadụ bụ ịchụpụ onye ahụ n'ala ahụ maọbụ ịkpọrọ onyeahụ gawa ajọ ọhịa ebe ọ ga-anwụ. Igbu onwe gị Ala ga-ajụ onye gburu onwe ya Dịka igbu mmadụ, igbu onwe bụkwa ihe ala na-asọ makana ọbara mmadụ dị n'ime ya. Nnabuihe kọwara na Ala na-ajụ ozu onyeọbụla gburu onwe ha. Tupu ha buru ozu onye ahụ gawa n'ime ajọ ọhịa, ndị dibia ga-achụ aja di icheiche iji sachapụ ajọ ihe ụdị ihe a nwere ike ibute n'ala ahụ. Ọ bụ mgbe e mechara emume a ka ndị ntorobịa ga-eburu ozu onye ahụ gawa ajọ ọhịa. Idina onye si ezinaụlọ gị Ihe a bụkwa ihe Ala na-ajụ bụrụkwa nnukwu arụ n'ala Igbo. Ọ bụrụ na nwa pụta na mmekọ a, ndị obodo ahụ ga-eburu ya gawa n'ime ajọ ọhịa ma chụpụkwa ezinaụlọ nwa ahụ n'ala ahụ. Igbo nwere nkwenye na Ala abụọla ezinaụlọ ahụ ọnụ. Idina anụmanụ Arụ a na-ebute ọrịa Ọ na-ahịa ahụ ịnụ na mmadụ mere ụdị ihe a n'ala Igbo. Mana mgbe ọbụla o mere, Igbo nwere nkwenye na Ala ga-ebunye onye ahụ ọrịa. Ọrịa a nwere ike ịbụ ara, ekpenta (Leprosy), afọ ọsịsa maọbụ nzịza (Dropsy) na ọtụtụ ndị ọzọ. Obodo ahụ ga-eji ngwa ngwa buru onye ahụ gawa ajọ ọhịa ebe ọ ga-anwụ. Ịmụ ejima Ụka Krist emeela ka Igbo kwụsị ọtụtụ iwu a Nke a na-agbawa obi mana ọ bụ amaghị ihe butere ya. Igbo nwere nkwenye n'oge gboo na Ala bụ mmụọ na-enye ndụ na-enyekwa nwa na-enye di na nwunye sọọsọ otu nwa n'otu ugboro. Ha nwere nkwenye na nwaanyị ọbụla mụrụ ejima nwere mmekọrịta n'aka nwoke nke abụghị di ya. Ihe a na-eme ma nwaanyị mụọ ejima bụ na a ga-eburu ụmụaka ahu na nne ha gawa n'ime ajọ ọhịa ebe ha ga-anwụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50499853,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499853,Cannibalism: Nwaanyị esiela ma rie nwa ya,"Gọomentị mba Tanzania zipuru ndị isi ọrụ ha n'obodo Mavanga ebe a na-enyo na otu nwaanyị gburu, sie ma rie nwa ya.","Akụkọ si mba ahụ apụta na-akọwa na anwụchiela nwaanyị ahụ na di ya maka ịgba ha ajụjụọnụ maka ihe mere nwa ha nwaanyị. Ndị isiọrụ ahụ kwuru na ihe a mere ebe mmadụ na-eri mmadụ ibe ya, wụrụ ha akpata oyi n'ahụ makana ha anụtụbeghị ya mbụ n'obodo ha. Napụ Invictus Obi ego, Ụlọikpe gọọmentị etiti dị na Legọs enyela iwu ka e weghara ihe karịrị nde narị abụọ na iri asatọ a chọtara n'ọbaego Obinwanne Okeke a ma dịka Invictus Obi. Ọkpaikpe Rilwan Aikawa nyere iwu a ka ndị ụlọọrụ EFCC kwuru na ha hụrụ ego ndị a n'ọbaego ya na nke ụlọọrụ ndị o hibere. N'akụkọ ọzọ, Anwụchiela otu nwoke a na-enyo na ọ chọrọ ịkpa mkpamkpa n'ime ụgbọelu Ethiopian Airlines feturu na Bujumbura dị na mba Burundi. Ụgbọelu ahụ si Addis Ababa na-aga Burundi nakwa Kigali dị na mba Rwanda, oge nwoke ahụ malitere ikwu na ọ ga-eji ogbunigwe gbarie ya bụ ụgbọelu. Mourinho agwala ndị ntaakụkọ okwu Jose Mourinho ekwuola na ọ gaghị eme mmehie ndị o mere mgbe ọ na-achịkọta otu ndị ọ chịkwa buru, ugbua ọ na-achịkọta Tottenham. 'Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ karịa ndi Boko Haram' Akwụkwọ nchopụta a kpọrọ Global Terrorism Index nke 2019 kwuru na ndị ọchịehi egbukarịala mmadụ karịa Boko Haram kemgbe n'afọ 2018. Akwụkwọ a bụ nke e wepụtara na Wednezde sị na Naịjirịa bụ ndị atọ na mba ụwa ihe iyi ndụ egwu kachasị metụta kamgbe afọ 2015. Dịka akwụkwọ a si kwuo na iyi ndụ egwu na Naịjirịa kachasị na nke ndị ọchịehi na ndị Boko Haram na-eme. Na ndị otu abụọ a akpaala ike iyi ndụ egwu dị pasentị 78 ebe ha gburula ihe ruru pasenti 86. Agbanyeghi na aha ndị ọchịehi a nọghị n'akwụkwọ ndị na-eyi ndụ egwu kama ogbugbu n'eso nsogbu ha na ndị ọrụ ugbo bụ ihe iyi ndụ egwu. Akụkọ a sị na ndị mmadụ nwụrụ n'afọ 2018 maka nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo eruola 1,158. Ọ sị na nke kachasị dị njọ bụ mwakpo mere n'obodo Gwaska dị na Kaduna, n'ọnwa Mee afọ 2018. Ikpe Sanusi na Ganduje Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir Taa ka a ga-ama ma nkewa Gọvanọ Abdullahi kewara ọchịchị ọchị ọdịnala nke Kano nke obodo ahụ nwee eze ise ọ ga-akwụrụ ụlọikpe ga-etinye ọnụ ma Gọvanọ Ganduje omere ọfụma ikeri ngalaba ọchịchị Emir Sanusi ụzọ ise pụtara Rano, Kano, Karaye, Bichi na Gaya. N'ofesi Akwụsịtụla ogbugbu ndị a mara ikpe ọnwụ n'Amerịka maka ikpe sịrị na usoro e ji egbu ha megidere iwu. Otu ọkaikpe chabiri ikpe ma kwuo na akwụkwọ mmadụ anọ n'ime ndị a gbara megide usoro ogbugbu ha nwereike ịmịta mkpụrụ. Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sunday Dare sị n'okwu ịgbatịkwu ọnọdụ Gernot Rohr dịka onye nchịkọta Super eagles dị n'aka ndị NFF. Gernot Rohr na NFF nwere site ugbua ruo ọnwa Juun afọ 2020 inwọgharị oge ọrụ maọbụ ya akwakọrọ pụọ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-55108902,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55108902,Ụdị nri ise nwereike ịkwalite ọmụmụ na nwoke,Ọmụmụ bụ otu ihe dị oke mkpa n'ịgbatị oge na ndụ ihe e kere eke n'ụwa.,"Mkpụrụ osisi na azụ na-enye aka Eke kere ụwa kere mmadụ ma nye ya ikike ọmụmụ nke pụtara na onye ọbụla (nwoke maọbụ nwaanyị) nwere onyinye ọmụmụ. Mana otu ihe maọbụ nke ọzọ nwereike imetụta ọmụmụ ọkachasị nke nwoke, mana e nwekwara nri ndị ga-enye aka ịkwalite ya. Otu dọkịta na-ahụ maka nnyocha ahụ mmadụ bụ Ugo Ezenyirioha sị na ụfọdụ nri ndị dịka azụ, mkpụrụosisi, mkpụrụ ụgụ, anụ, akwa na ndị ọzọ na-akwalite uhe (sperm) nwoke. Ka anyị tulee ụfọdụ ihe nri ndị a bu nwereike ịkwalite ọmụmụ nwoke. Azụ Azụ nwere obere abụba ma nwekwaa Omega 3 nke na-enyere nwoke aka maka ọmụmụ Ụfọdụ azụ nwere akụrụngwa a na-akpọ 'Omega 3 fatty acids' nke na-enye aka na ime ka ọbara na-eru na mkpụrụ amụ nwoke nke ọma. Nnyocha egosikwala na Omega 3 na-enyekwa aka ime ka ọnọdụ uhe nwoke kawanye mma Mkpụrụosisi Mkpụrụosisi ndị dịka unere, karọt, oroma, beris na ndị ọzọ na-arụkwa ọrụ n'iwulite ọmụmụ na nwoke. Unere (banana) jupụtara na vitamin B1, C, magnesium na bromelain bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọmụmụ nwoke. Karọt nwere beta-carotene nke na-echekwa ndụ uhe megide 'free radicals nwereike igbu ya. Oroma nwekwara vitamin C Akwụkwọ nri na-acha ndụ ndụ Akwụkwọ nri na-acha ndụ ndụ dịka ụgụ na ndị ọzọ na-enyekwa aka Akwụkwọ nrị na-acha ndụndụ nwere ihe a na-akpọ 'folate'. Akụrụngwa a na-enyere ụmụnwaanyị aka ịtụrụ ime, ma na-enyekwa aka ichekwa uhe (sperm) nwoke. Iji maa atụ, mkpụrụ ụgụ jupụtara n'akụrụngwa ndị dịka antioxidants, phytosterols na amino acid na-enye aka iwulite ọmụmụ nwoke. Ọ na-enyekwa aka ịgbalite ọnụọgụgụ uhe (sperm count), nakwa njem uhe n'ahụ nwoke. Akwa Akwa bụ otu n'ihe nri nwere ezi mgbọrọgwụ na mmepụta uhe n'ahụ nwoke. O nwere vitamin E, zinc na protein b ụ ndị na-enye aka ka uhe nwee ike gazuo ebe o kwesịrị n'ahụ nwoke. Akwa nwereike ichekwa uhe megide 'free radicals' nke mere ka ohere ọmụmụ na nwoke dị elu. Tomato Tomato bụ kwa nri ọzọ na-agbali ọmụmụ na nwoke. Ha nwere akụrụ ngwa a kpọrọ lycopene bụ antioxidant na-akwalite ụdịdị na etu uhe ji arụ ọrụ. Ị na-eri tomato kwa mgbe na-ewulite ọmụmụ n'ahụ nwoke. Anụ Anụ ọbara ọbara a kpọrọ 'red meat' na bekee nwere ọtụtụ uru nwekwaa ọghọm. Otu uru dị na ya bụ na ha nwere akụrụngwa ndị dịka zinc , folic acid na selenium bụ ndị na-enye aka iwulite uhe dị nwoke n'ahụ nakwa ọmụmụ. Mana ọ dịghị mma iri anụ ndị a ebe o buru ibu ruo ogologo oge, maka na ha nwekwara oke abụba nke nwere ike ime ka 'cholestrol' dị mmadụ n'ahụ gbalie. Ihe ọtịta a kpọrọ 'nuts' Dọkịta Ezenyirioha gara n'ihu kwuo na ihe ọtịta nke Bekee kpọrọ 'nuts' na-enyekwara nwoke aka. Ha gụnyere: Akị awụsa (tiger nuts), akị oyibo, Walnut, 'datenuts', dịrị gawazie. Garlic na nri ndị ọzọ nwere Vitamin C, E, B12, D-aspartic na Zinc na-enye aka iwulite uhe. Ọ sị na ndị ọrụ ahụike na-enye ndị ọnụọgụgụ uhe dị ala ndụmọdụ ka ha na-eri ụdị nri ndị a." afirika-51450723,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450723,Beer Belly: Gịnị na-enye ụmụnwoke 'afọ beer'?,Ị bụ onye afọ 'beer' ka ị ma onye nwere afọ 'beer'? Akụkọ a bụ maka gị.,"Oge agaala mgbe a na-ahụbu afọ ukwu dịka ihe na-egosiputa nwoke nwere ego; ugbua ọtụtụ ụmụnwoke na-atazi igwe 'gym' ịhụ ma afọ ha ọ ga-ata. Ọtụtụ afọ ukwu ahụ anyị na-ahụ ndị nna anyị na ụmụnne anyị ndị nke nwoke na-ebugharị bụ ihe a ṅụtara na 'beer'. Mana gịnị mere o ji bụrụ ụmụnwoke na-enwekarị 'afọ beer'? Mmanya 'beer' na-ebu ihe Bekee na-akpọ 'calorie' bụ ihe mere mmanya ahụ ji ebu mmadụ ibu. Mana n'ụmụnwaanyị, ibu ahụ na-agazu ha ahụ gaa dọrọ ha n'ukwu na ike ha. Mgbe ahụ nri anaghị agbarizi ọsịsọ etu o si emebu mgbe onye ahụ na-etolite etolite, nke bụ na onye na-anaghị emegharị ahụ ga-ahụ ka ya na afọ na-alụ ọgụ. Ọ bụ naanị 'beer' na-eme ka afọ buo ibu? Ọ bụghịkwa na ọ bụ naanị beer na-eme ka afọ mmadụ buo ibu, ibu afọ mmadụ na-ebu na-esikwa n'abụba na-ekweghị agbari agbari nke Bekee kpọrọ Visceral fat. Ndị na-arịa ọrịa dịka ọrịa shuga, ọrịa obi nakwa ọrịa ndị ọzọ na-egbochi ngagharị 'insulin', nwekwara ike inwe afọ ukwu. Ndị dọkịta na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịta ahụ na-ekwu na 'Visceral fat' a na-agbarinwu ma ọ bụrụ na ị gbanwee ụdịrị nri na-ebu afọ ị na-eri (nri nwere carbohydrates na shuga), wetulata aka na nri ị na-eri (portion control), ma na-agbatịkwa ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Mgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala" afirika-53711043,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53711043,Bayern Munich vs Chelsea: Munich emegheela ọnụ ụzọ eluigwe kwapụ Chelsea,Ndị Bayern Munich pịkọrọ Chelsea ka mpempe akwụkwọ tụfuo ha dịka ha ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie ha mgbe ha zutere n'Allianz Arena.,"Naanị otu goolu Tammy Abraham nyerela Chelsea na nkeji 44 ezughi ịzọpụta ha n'aka ndị Bayern bịara ịgwọ ha ara. Robert Lewandowski bu ụzọ jiri penariti dọkaa neetị Willy Caballero na nkeji 10, tupu Ivan Perisic emezuo ya abụọ na nkeji 24. Corentin Tolisso tụkwasịrị ya nke atọ na nkeji 76, tupu Lewandowski akụnyezie ntu n'igbe ozu Chelsea na nkeji 83. Mkpokọta goolu anọ a satara otu ha gbara (4 - 1) na nke atọ a na-asaghị asa (3 - 0) ha ji zọgbuo Chelsea mgbe ha bịara Stamford Bridge n'ọnwa Febrụwarị, ka ha ji kwapụ Chelsea n'asọmpi Champions League nke afọ a. Chetakwa na ọ bụ ha ka Chelsea meriri wee bulie iko Champions League mbụ ha n'afọ 2012. Ka ọ dị ugbua, Bayern Munich ga-ezute Barcelona n'agba nke anọ-ikpeazụ n'ụbọchị Fraịde bụ 14 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe ha ga-ama onye a ga-agbara ụgbọ nwa mkpi." afirika-51665159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665159,Cheating in Relationships: Ụmụnwoke a ka ụmụnwaanyị agba n'ezi?,"Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-eche na ụmụnwoke na-agba n'ezi karịa ụmụnwaanyị, mana ọ bụ eziokwu?","Ọtụtụ mmadụ ga-akpọ ihe dị iche iche ịgba n'ezi, mana ọ bụghị onye niile ga-akọwanwu ihe ha chere ga-ebutenwu ha ịgba n'ezi. Ọtụtụ ndị mmadụ amaghịkwa ihe ha ga-eme ma ha chọpụta na onye otu ha gbara n'ezi, n'agbanyeghi na ha etuola ọnụ ihe ha ga-eme tupu ya bụ ihe emee. Ebe ọtụtụ ndị ọzọ anaghị ekweta na onye nke ha gbara n'ezi, ma ọ bụghị ma ọ bụzị onye ahụ jizi aka ya kwupute ya. Ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị na-atụ ụjọ na ndị otu ha ga-agbarịrị n'ezi. Ụzọ ụfọdụ si agba n'ezi Ihe ụfọdụ kpọrọ ịgba n'ezi abụghị ihe ibe ha na-akpọ ya. Mana lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-akpọ ịgba n'ezi: Mana kedụ onye ka agba n'ezi n'etiti nwoke na nwaanyị? N'akụkọ BBC dere oge gara aga, ha tinyere nchọpụta na ọtụtụ ndị gbara n'ezi ekwebughi na ha ga-agba n'ezi. N'afọ 2000, ngalaba a kpọrọ ""National Survey of Sexual Attitudes and Lifestyles"" (Natsal) mere nnyocha ma chọpụta na pasentị ụmụnwoke 15 gbara n'ezi, ebe pasentị ụmụnwaanyị itoolu mekwara otu ihe ahụ. Dọkịta Catherine Mercer, bụ onyeisi ndị mere nchọpụta Natsal a, kwuru sị na ohere a dị n'etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwereike ịbụ n'ihi na ọ na-ara ụmụnwaanyị ahụ ikwenye na ha gbara n'ezi karịa ụmụnwoke. O kwuru sị ""Anyị enweghi ike ileru anya mara mgbe mmadụ gbara n'ezi, ya mere anyị ga-eji dabere n'ihe ndị mmadụ gwara anyị. Anyị makwu na ihe dị iche iche dị n'ihe gbasara etu nwoke na nwaanyị si ekwuputa maka mmekọrịta."" Nchọpụta Natsal kọwara na ihe ndị iche ji dịrị na pasentị ndị na-agba n'ezi bụ na ụmụnwaanyị anaghị edinakarị ọtụtu ụmụnwoke, ọzọ bụkwa na o nwereike ịbụ maka afọ ole onye dị. ""Anyị ma na ụmụnwoke na-atọkarị ụmụnwaanyị ọ bụ ha na ha. Ị chee ya eche hụ ebe nwoke dinara nwaanyị (nwereike ịbụ na o nweghi enyi nwoke) ọ tọrọ ọfụma ma ọ gbaa n'ezi, ị ga-ahụ na ọ bụ ya kacha nwee ike ịgba n'ezi karịa nke nwaanyị."" Mana nnyocha e mere n'afọ 2017 na-akọwa na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-agba n'ezi aharala. Ndị kacha nwee ike ịgba n'ezi Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?" media-47789836,https://www.bbc.com/igbo/media-47789836,Abike Dabiri: Okwu ndị zuru ohi na Dubai abụghị okwu agbụrụ,Ụmụ Naijiria ọkachasị ndị Igbo e jirila ọnụ saa onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Abike Dabiri ka akwa.,"Nke a bụ maka okwu o kwuru maka ụmụ Naijiria a nwụchiri n'ala Dubai maka ịga ohi n'ụlọ mgbanwe ego zuo nde Dh abụọ na ụma. N'ụbọchị Monde, Dabiri-Erewa kwụrụ na Naijiria ga-ana akpọpụtazị aha ndị mere mpụ na mba ọzọ iji menye ha ihere n'ihu. Nke a na-eme dịka ọ kpọpụtara aha mmadụ ise bụ ndị Igbo a nwụchiri maka izu ohi na Dubai. End of Twitter post, 1 Mana ụkwụ ahụ ọ zọpụrụ were ọtụtụ ụmụ Igbo iwe. Ọtụtụ kwuru na ọ kpọpụtara aha ndị ahụ iji kwaa Ndigbo emo dịka ọ hapụrụ ịkpọpụta aha ndị agbụụ ndị ọzọ e jiderela na Dubai maka ibu ntụ na mpụ ndị ọzọ. @soulwinner4sure kwuru na ọ dị mma ka ndị zuru ohi taa ahụhụ dịrị njọ ha mana ya (Dabiri-Edewo kwesịrị iwepụ akpọmasị n dịka onye ndu. @il_Cavalier Na ahụta okwu dịka ịkparị ndị agbụụ ndị ọzọ. @edozie01 kwuru na ọ bụ ihe ihere na Dabiri chezọrọ ịkpọpụta aha mmadụ ise e gburu na Saudi Arabia maka ibu ntụ. ""Okwu abụghị maka agbụrụ onye si na ya. Onye ọbụla si Naijiria gaa mba bụ otu akwụkwọ Ala Naijiria aga."" ""Anyị e kwesịrị ị na-eto ndị gara zuo ohi na Dubai?"" ""Aha ndị a kpọpụtara na foto ha efesasiala n'ebe niile na mba ha gara ohi."" O kwuru na ndị ahụ ga-ata ahụhụ dịị ha maka mpụ ha mere. Akụkọ ga-amasị" afirika-48488623,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48488623,Anthony Joshua: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọdịda Anthony,Biko ọ bụ ihe ọjọ mmadụ ikwado onye be ya ma a na-eme asọmpị na mba ọzọ?,"Udiri ajụjụ ga-adị n'obi Abike Dabiri ugbua dịka ndị mmadụ chịrị wunyere ya maka etu o si depụta nkwado ya nyere ọkpọ Anthony Joshua na Andy Ruiz tiri. Lekwa ozi o depụtara n'elu Twitter ya End of Twitter post, 1 Mana ozigbo etichara ọkpọ ahụ, ọ bụrụ na Anthony Joshua dara ada, ụmụ Naịjirịa kpụrụ Abike Dabiri-Erewa n'ọnụ. @dsadnezz kwuru na ọ bụ makana Abike na ndị otu ya gara ikiri ya bụ ọkpọ mere Anthony Joshua ji daa. ‏@ELEGBETE1 kwuru na Joshua na-emeri ọkpọ o na-etibu mana mgbe gọọmenti etiti na Abike banyere n'okwu ya, ihe ghasaa. @DemolaOjo kwuru na kamgbe Joshua dara ọkpọ ya na Ruiz, Abike ekwubeghị okwu ọbụla. Mana @BabajideFadoju katọrọ ndị na-akọjọ Abike ma kwuo na ọ bụ amaghị ihe na-eme ha. @abiola_soremi kwadoro ekpere Abike kpere Anthony Joshua n'ọkpọ a. Abike zọrọ isi onwe ya Mgbe ndị mmadụ katọrọ etu o si kwupute na ndị ọrụ gọọmenti anọ gbatara akwụkwọ iji kirie ya bụ ọkpọ, Abike depụtara ihe ndị a na twitter ya. @abikedabiri jụrụ ma ọ bụrụla njọ ka ndị ọrụ gọọmenti anọ ga kirie ya bụ ọkpọ. Ihe ọ sara ndị si na ọ bụ ego gọọmenti etiti ka eji zụta ya bụ akwụkwọ iji kiri ọkpọ ahụ. Cheta na Andy Ruiz piatụrụ Anthony Joshua n'ala ugboro anọ mgbe ha pịara ọkpọ n'ọgbo egwuregwu Madison Square Garden wee maburu ọkwa atọ ụnyahụ bụ ụbọchị nke mbụ ọnwa June. Anthony Joshua na-apịachitere ndị mba Britain ọkpọ mana ọ bụ nwafọ Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52336365,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52336365,Abba Kyari: Ihe asatọ mere ndị mmadụ ji kpọọ ya asị,Abalị abụọ agafeela kamgbe onyeisi ndị ọrụ n'ọchịchị Buhari bụ Abba Kyari nwụrụ n'ihi coronavirus mana ndị mmadụ ka na-ekwu gbasara ya.,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Abba Kyari makana ha che na ọ ka onyeisiala Buhari ike agbanyeghị na onye nke ahụ na-achị Najirịa. Mana ụfọdụ ndị ya na ha mekọtara ihe na-ekwupuru udiri mmadụ ọ bụ mgbe ọ dị ndụ. Lekwa ihe ndị ọzọ mere ha ji kpọọ ya asị Etu Abba Kyari si nwụ N'abali Eprelu iri na asaa nke afọ 2020 ka ọnụ na-ekwuru onyeisisala Buhari depụtara n'akara twitter ya na onyeisi ndị ọrụ Naijirịa bụ Abba Kyari dị afọ iri isii nwụrụ site ọrịa coronavirus. Cheta na n'abali iri ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Maachị ka akụkọ pụtara na Kyari butere coronavirus. A na-eche na o butere ya Germany mgbe ọ gara nkem nleta. Ka izu uka atọ gachara, e bu ya gawa Abuja ebe ọ n'ọnọdụ ọnwụ. Ọnwụ ya ka ọtụtụ ndị mmadụ bi na Naịjirịa nakwa mba ofesi kpụ n'ọnụ makana ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọkwa ya mgbe ọ dị ndụ metụtara ụmụ Naịjirịa. Ndụ ya 1.A mụrụ Abba Kyari na Borno. 2. Ọ gara Mahadum Warwick gụọ ""Sociology"" n'afọ 1980 nakwa Cambridge ebe ọ gụrụ ọkaiwu. 3. Ọ bidoro rụwa dịka ọkaiwu na Naịjirịa n'afọ 1983. 4.Ọ rụkwara dịka onye nta akụkọ n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị na Kaduna n'afọ 1988 ruo 1990 5. Ọ rụkwara dịka kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ụgbo na Borno steeti 6. N'Ọgọstụ nke afọ 2015, Buhari kpọpụtara Abba Kyari dịka onyeisi ndị ọrụ ya. Ihe ndị mmadụ kwuru mgbe Kyari nwụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na Abba Kyari bụ nwoke aka ya kwụ ọtọ n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ. O kwuru na ya na Kyari bụ ọyị kamgbe afọ iri anọ na abụọ. Buhari kwuru na Kyari bu ọdịmma ụmụ Naịjirịa n'obi tupu ọ nwụọ. Nwunye onyeisiala Buhari bụ Aisha kwuru ka chukwu tie ndị bee Kyari aka n'obi maka ọnwụ ya Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na ndị mba ọzọ kwuru na n'ọdịnihu, ụmụ Naịjirịa ga-ahụ na Abba Kyari bụ ezigbo mmadụ n'ezie. Atiku Abubakar bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru ka chukwu nara mkpụrụobi Abba Kyari. Onye bụbụ mịnista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani- Kayode na ọyị kamgbe afọ iri anọ anwụọla. Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP ziterekwara nwute ha Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-44625570,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44625570,Ị ma ihe ọzọ 'Igbo' na-eme n'ahụ mmadụ karịa ịkwụsị ahụ mgbu?,Bekee nakwa ndị Igbo na-eme nyocha ma na-achọpụtakwa ihe ndị ọgwụike akpọrọ 'Igbo' na-eme n'ime ahụ mmadụ.,"Ihe ise 'Igbo' na-eme n'ime ahụ Achọpụtala ugbua na ọ na-enye aka ibelata ahụ mgbu nye ọtụtụ ndị mmadụ na-arịa ọrịa. BBC Igbo gbara otu onye dibia bekee ajụjụ ọnụ n'okwu gbasara ise Igbo iji maata ihe ndị dị mma na ndị dị njọ maka ya. Ọ dọọla aka na ntị kwuo na ọ ka mma na mmadụ ebidoghi ise ọgwụ n'ihi na ọ naghị ekwe nkwụsị gụnyere ihe ndị ọzọ ọ na-eme n'ime ahụ mmadụ. O kwukwara na ụfọdụ mmadụ na-agbapụ ara n'ihi ọgwụike a. Gee ihe ọ gwara BBC n'uju n'elu: Lee ihe 'Igbo' nwere ike ime na ndụ mmadụ: 1. Ọ na akwụsị arụ mgbu Agụnwa ekwuola ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na mbụ mgbe ọ gwara BBC na Igbo na-ebelata ahụ mgbu n'ihi n'ọnwere ike ị me ka ahụ maadụ daa juuu. 2. Ọ na-eme ka nwoke na-achọ nwaanyị nakwa nwaanyị na-achọ nwoke. Ọ bụ ihe ọma diri ụfọdụ mmadụ ị ji Igbo dịka ọgwụ enyemaka na mmekọahụ, mana ụfọdụ oge kwa, ọ na-eme ka mmadụ ghara ị mekọahụ ma ọbụrụ na ha esghị Igbo. 3. Ọ naghị agwọ orịa ịkpa Dịka ọgwụ na-enye aka ị belata ahụ mgbu, ọ naghị agwọ ọrịa ọbụla ọzọ kachasị ọrịa ịkpa bụ 'Cancer' na bekee. Sọsọ ihe o nwereike i me bụ ị belata ahụ mgbu ndị na-arịa ọrịa ahụ. 4. Ọ na-agbanwe ime ahụ mmadụ n'ụzọ adịghị mma Ọ bụ n'ụbụrụ ka mgbanwe a kachasị na-egosi. Ọ na-eme ka onye na-emebu ihe ghara i nwe ike i me ihe ọ na-eme tupu o bido i see ya bu ọgwụike. Ya mere na ọ ga-eme ka ọ na-ese ya oge niile. Ọ na-eme ka agwa mmadụ na-agbanwe agbanwe oge ọbụla dịka onye na-achọ ịgbapụ ara. 5. Ọ naghi ekwe nkwụsị Ọ ka mma na mmadụ ebidoghi ise ọgwụ n'ihi na ọ naghị ekwe nkwụsị Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43071952,https://www.bbc.com/igbo/43071952,Ipob: Tọhapụ ndị otu anyị,Otu na-azọ maka ị nwere onwe ha bụ Indigenous People of Biafra na-etị mkpu ka gọọmentị ala Naijịrịa tọghapụ ndị otu ha e jịrị na mkpọrọ di iche iche n'ala Naijịrịa kpọm kwem.,"Nnamdi Kanu bụ onye isi otu IPOB Ipob kwuru ihe a n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful zipuru ndị ntaakụkọ. Emma kwuru na ọbụrụ eziokwu na Ipob bụ ndị otu iyi egwu, anaghị aga ụlọ ikpebi nsogbu ha na gọọmentị ala Naijịrịa. ""Anyị bụ otu na-agbasa ozị udo. Ugbu a, gọọmentị anaghị ewepụta otu onye akaebe ga-ekwu na Ipob mere njọ niile ha kwuru na ha mere"" Emma jụrụ ajụjụ, ""Onye bụ onye akaabe gọọmentị kwuru na onye isi anyi bụ Nnamdi Kanu na ndị otu anyị bụ Benjamin Madabugwu, David Nwawuisi, Chidiebere Onwudiwe na ọtụtụ otu IPOB gọọmentị jịrị na mkpọrọ di iche iche n'ala Naijịria?"" IPOB na-ekwusi ike na ha bụghị otu iyi egwu Emma kwuru na maka ihe a, ụlọ ikpe ala Naijịrịa abụọla ihe e ji achị ọchị n'ala ndị ọzọ. Ke mgbe ọnwa Seputemba n'afọ 2017 ka ndị agha ala Naijịria nwapo bee Nnamdi Kanu n'Abia steeti. Mana ugbu a, onweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ. Ọ bụ n'ọnwa Jenuwarị ka ụlọ ikpe ala kpọrọ Ipob otu na-eyi egwu." 46303153,https://www.bbc.com/igbo/46303153,#FaintingDanceChallenge: Ọ bụzị ịma aka ka ụmụ Naịjirịa ji biri?,"Ufodụ ụmụ Naijiria na bụ ụgbọ ọbụla gaferela, ha soro ya gawa.","Ụmụ Naịjirịa na-ejikarị ịmaka gasị akpa onwe ha ọchi Nke a gụnyere ị ma aka dị iche iche wurulanụ ma gafee na etu o si metụta ụfọdụ ụmụ Naịjirịa. Anyi ga-ebido na nke na-ewu ugbua akpọrọ ""#IdibalaChallenge"" Ọtụtụ mmadụ na-akpọkwa ya ""Fainting dance"" bụ egwu na-eme ka ndị mmadụ dinaa ka ndị kụbiri ume ebe ọ bụla ha hụrụ onwe ha ma egwu so ya na-akpọ. Ụfọdụ na-edina na mmiri maọbụ na okporoụzọ. Kamgbe ọ pụtachara, ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ṅomiri ya ma tinye ya na soshal midia ka ụwa kirie. Ọ bụkwa otiegwu onye mba South Afirịka akpọrọ King Monada tiri egwu a. O kwuru na ọ bụ maka obi enyi ya nwaanyi gbawara mere o ji arịa ọrịa ndatu n'egwu ahụ. Aha Egwu a bụ Malwedhe. #KupeChallenge Kamgbe ụmụ okorọbịa anọ si na mba France wepụtachara ihe onyoonyo ebe ha na-agba egwu ""Kupe,"" social midia nwuuru ọkụ. Kupe bụ egwu otiegwu si mba Ghana akpọrọ Ebonyi tiputere. Mana ndị mmadụ na-ekwu na ihe mere egwu ụmụ okoroọbịa a ji pụọ iche bụ na ha bụ onu gbajie ""ụmụ nwaanyị."" Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ji akara akpọro #KupeChallenge wee gbawa egwu a ụmụ okorọbịa gbara. Nke a mere ka ụmụ okorọbịa a gbara Kupe wuchie na Naịjịrịa. Ọzọkwa kopuru mba ụwa bụ #KikiChallenge#InMyFeelingsChallenge Ị maka aka a bụ ebe mmadụ ga-esi na ụgbọala ya ka na-aga n'ụzọ wụpụ gbawa egwu. O bidoro wube na soshal midia n'ọnwa July nke afọ 2018. Ọ bụ otiegwu ama ama na Kanada tiputere egwu a mana ọ bụghị ya mere ka ndị mmadụ were ya na-eme ị ma aka. Otu onye na-eme ihe nkiri ama ama na mba America bụ Will Smith mebigara nke ya oke. Lekwa nke nwata nwaanyị a: #MannequinChallenge N'afọ 2016, ụmụ akwụkwọ mba Amerika bidoro ị kwụ ka nwa bebi eji akpọsa ahịa akwa ma egwu na-eti. Ọtụtụ mmadụ pụtara mewe ihe a tụmmadị na Naịjirịa. #MannequinChallenge bụ okwu eji mara ya na internet mgbe ahụ. Onweghị ihe achọpụtara na ọ bụ maka ya ka eji wepụta ya bụ ịma aka . Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ maka ịkpaọchị ka ndị mmadụ ji eme ya mgbe o wuru. Ndị dịka Hillary Clinton, nwunye onye chiburu Mba Amerika bụ Michelle Obama so na ndị mere ya bụ ịma aka mgbe owuru na soshal midia. #IceBucketChallenge Ihe ọzọ wuru ewu na soshal midia ndị dịka ome ihe nkiri bụ Genevive Nnaji mere bụ nke akpọrọ ""Ice Bucket Challenge"". Ndị mba Amerika wepụtara ihe a ka ha wee mee ka ndị mmadụ mara maka ọrịa agwọta agwọta bụ ""Amyotrophic Lateral Sclerosis"" na-eme na be ha n'afọ 2014. Ọrịa ""Amyotrophic Lateral Sclerosis"" enweghị ngwọta nke na-ebute ọnwụ onye ọ na-arịa Mana ọtụtụ ụmụ Naịjrịa ga buru ya n'isi. Ndị ama ama so mee ịhe a gụnyere aka chiburu Mba America bụ George W. Bush, Mike Zuckerberg, Don Jazzy, Davido, Ice Prince nakwa ndị ọzọ. @davidoofficial mere nke ya. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ dịka ha na-eche ka ịma aka pụta ka ha were ya na-eme ihe ịkpaọchị. Ọnye ma nke ga-fịọ ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 53703214,https://www.bbc.com/igbo/53703214,Juventus na Lyon: Urata ekwoola n'isi Christiano Ronaldo na ndị Juventus,Christiano Ronaldo na ndị otu ya bụ Juventus aghọọla Erọn gbara aka laa n'asọmpi UEFA champions league nke afọ 2020.,"Olympique Lyon nke mba Fransi dulara ha mmụọ n'abalị Fraide. Juventus ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Lyon, mana o zughi iji bufee ha n'agba nke ọzọ. Cheta na Lyon jibu otu ọkpụ goolu asataghi asata merie Juve oge ha abụọ zutere na Fransi. Nke a pụtara na Lyon lafeere site na nke Bekee kpọrọ 'away goal rule'. Ihe kpatara nke a bu na ha nyetere otu goolu na be Juve, mana Juve enyeteghi goolu ọbụla na be ha. Ọ bu Ronaldo nyeteere Juve goolu abụọ n'abalị Fraide, ebe Memphis Depay nyere otu goolu nke ndị Lyon. Manchester City gbara Real Madrid ụgbọ nwa mkpi sị ha kwakọrọ pụọ n'asọmpi Uefa Champions League. Ha mere nke a site n'iji goolu abụọ asatara merie n'ụkwụ nke mbụ ma were goolu anọ asatara abụọ na ngụkọ sị sie Madrid ka ọ dị. Ha malitere ibu nye madrid akpa njem ụla na nkeji 9' mgbe Raheem Sterling nyere goolu. Mana Real Madrid jụrụ ịmaburu akpa a mgbe Kareem Benzima sara goolu ahụ na nkeji 28'. Mgbe ha batara n'ọkara abụọ n'asọmpi a ka Gabriel Jesus siri ọnwụ nye Real Madrid goolu ọzọ na nkeji 68' nke mere ka olileanya ha agwụ. Madrid siri ọnwụ ka dimkpa ha bụ mana Man. City fooro ntụtụ taa sị na Madrid ga-abarịrị n'ụgbọ nwa mkpị a. Etu a ka ọ dị ruo mgbe ogbu pịpịrọ gbuchiri asọmpi ahụ. Mmerie Man. City mere ka ha tozuoke n'ọkara ikpeazụ asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020 ebe Real Madrid akwakọọrọla pụọ." afirika-47944824,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47944824,Priscilla Ekwueme Eleje: Onye bụ nwaanyị a na-akpa ike?,"Priscilla Ekwueme Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya na-apụta n'ego Naịjirịa nke otu puku, n'ime afọ iri isii na otu.","Ọ bụkwa nwaanyị nke mbụ ga-anọ n'ọkwa ""Director of Currency Operations"" n'ụlọakụ etiti na Naịjirịa. Ihe abụọ ndị a bụ ihe mere o ji ewu ewu ebe niile na Naịjiria gụnyere soshal midia. End of Twitter post, 1 Lee ihe ndị anyị chọpụtara maka ya. EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị Ọ bụ onyeisi na-ahụ maka ngagharị ego na Central Bank bụ ụlọakụ etiti Naịjirịa. Priscillia ga-esonye Ngozi Okonjo Iweala na Sandie Okoro bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa abụọ nwere ọkwa n'ụlọakụ ukwu nke ụwa niile. Anyị ga-ewetakwa ihe ndị a na-amaghị maka Odoziakụ Priscillia Ekwueme Eleje. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44014706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44014706,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Benue na-akwado ị kpe gọọmenti na UN,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Otu dị iche iche n'ime Benue chọrọ ị kpe gọọmentị na UN,"Otu dị iche iche n'ime Benue steeti ekwuola na ha ga-ekpe gọọmentị Naịjirịa na ngalaba na achịkọta mba uwa akpọrọ United Nations na bekee. Ha kwuru na ha na-ekpe gọọmentị makana ha sara anya na-ele ka ndị ọchị ehi jiri egbe na-egbu ọtụtụ mmadụ na Benue steeti Ọkụ erefuola ego ruru nde naira 506 n'Anambra Onye isi ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ n'Anambra steeti bụ Martin Agbili ekwuola na akụ ruru nde naira narị ise na isi bụ ihe lefuru n'ime ọtụtụ ọkụ gbara na steeti ahụ n'etiti ọnwa December afọ 2017 na Epureel 2018. O kwuru nke a n'ụbọchị ncheta ndị ụlọọrụ mmenyụ ọkụ ha mmere na Awka. Mana o kwukwara na makana ọtụtụ mmadụ na-akpọ ha oge niile ọkụ na-agba, ụlọọrụ ha zọpụtara akụ ruru ijeri naira iri na otu na abụọ. Ugwu na-agbọpụta aja ọkụ emebiela ọtụtụ ụlọ na Hawaii Gọọmentị ala ahụ agwala onye ọbụla bi na mpaghara ebe ihe a mere ka ha gbaa ọsọ ndụ kpam kpam. Ha kwuru na maka ikuku sulphur dioxide kari akari na mbara ikuku, agaghị enwe ike ị zọpụta onye ọbụla ka nọ n'ebe ahụ. Brighton na Holve Albion na-achị ọchị N'egwuregwu Otu Brighton na Holve albion emeriela Manchester United n'asọmpị iko Premier League otu akpụ asataghị ihe. Mmeri Brighton n'asọmpị a mere ke a pụọ n'ime otu ato nọ n'ikpeazu. Manchester United ka nọ na akara abụọ n'asọmpị iko Premier League. Gee akụkọ anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47275945,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47275945,APC Caucus meeting: Nyụọnụ onye ọbụla ga-anapụ igbe vootu n'ike ịkpakwụ - Buhari,Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụla napụrụ igbe ntuliaka maọbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ji ndị agboro akpa ike n'oge ntuliaka na-abịa ga-atunye ndụ ya.,"Buhari onye kwuru nke a n'ọgbakọ imeụlọ APC nwere N'Abuja n'ehihe Monde sịrị na ya enyela iwu ndị ọrụ nchekwa ka nyụọ onye ọbụla ga-anapụ igbe vootu n'ike ịkpakwụ. ""Agwala m ndị ọrụ nchekwa na onye ọbụla napụrụ igbe vootu na ntuliaka maọbụ onye ndọrọndọọ ọchịchị ji ndị agboro kpa ike, ha merela ya ebere ma ncha."" ""Achọrọ m ka a kwanyere ụmụ Naijiria ugwu, hapụ ha ka ha tụnyere onye masịrị ha."" End of Twitter post, 1 N'okwu gbasara nhighari Inec higharịrị ntuliaka, Buhari kwuru na o nweghị nkọwa ọbụla ha nyere ga-adaba n'ihi na ha nwere ogologo oge nakwa ego iji rụọ ọrụ ha dịka o kwesịri. ""Inec nwere oge na ego dị mkpa iji rụọ ọrụ ha nke na ịma ọkwa nhigharị ahụ naanị awa isii tupu ntuliaka enweghị ihe ha ga-eji agọpụ isis onwe ha n' arụghị ọrụ ka dịka o kwesịrị. Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-enyocha ihe mere ma e mecha ntuliaka. N'okwu ya onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole kwuru na o nweghị ihe Inec ga-eji gọpụta isi onwe ya n'ihe mere, ma kpo oku ka e nyocha mata ndị kụrụ ụgba ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44935543,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44935543,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ihe onyonyo egosila onye nchịkọta bọọlụ Naịjirịa ka ọ naara ego,Ihe onyonyo egosila onye nchịkọta bọọlụ Naịjirịa na-anata ego,"Salisu Yusuf kpọ otu egwuregwu Naịjirịa garuo agba ikpeazụ nke CHAN 2017 Ihe onyonyo ụlọọrụ 'BBC African Eye' wepụtara egosila otu onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Salisu Yusuf, ka ọ dị ka ọ natara ego iji tinye aha mmadụ abụọ so gbaa asọmpi CHAN nke afọ 2017. Mana Salisu kwuru na ọ daghị iwu FIFA nakwa nke NFF; na nghọpụta o mere bụ nke ziri ezi. Achụpụla ndị batara n'Enugwu n'ụzọ ezighi ezi Ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ bụ 'Immigration Service' na Bekee nke Enugwu steeti, ekwuola na ha anwụchiela ma chụlaa mmadụ iri asaa na ise (75) batara Enugwu n'ụzọ na-ezighi ezi. Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Dora Amahian, kwuru na ọtụtụ n'ime ndị a si na mba Niijee nakwa mba Kameroon. Saraki asaala oku ndị uweojii kpọrọ ya Onyeisi ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki asaala oku ọzọ ndị uweojii kpọrọ ya maka ohi e zuru n'ụlọakụ dị n'Offa, Kwara Steeti. O kwuru na oku a bụ nkatọ aha n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị. Nke a dị n'akwụkwọ ozi si n'aka onye ndụmọdụ ya na mgbasa ozi bụ Yusuph Olaniyon. Ụmụaka tọrọ n'ọgba Thailand ga-abụ ndị Mọnk Ụmụaka egwuregwu bọọlụ Thailand ga-enweta echichi ndị mọnk mana otu n'ime ha agaghị eso makana ọ bụ onye okpukpere ụka Kraịst. Nke a bụ omenaala ndị mba Thailand na-eme maka ndị gabigara ihe ike na ndụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri nke taa: SON: Anyị na-amachị ngwa ahịa adigboroja kwa ụbọchị" afirika-50890117,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50890117,POS charge: 'Onye anwakwala anwa kwụọ N50 maka POS' - CBN,Ụlọakụ ukwu Naịjriịa agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ịkwụ ya bụ ego ndị na-ere ahịa ụfọdụ na-ama maka iji POS kwụọ ụgwọ.,"Maka ịkwụ ego POS Otu n'ime ndị isi na Central Bank nke Naịjịrịa bụ Musa Jimoh kwuru na ndị mmadụ ghọtahiere ya bụ atụmatụ. Jimoh sị na iwu gọọmenti kwuru ka ndị na-ere ahịa kwụwa ụgwọ nke ha kpọrọ ""stamp duty' na Bekee. Mana o nweghị mgbe ya bụ iwu kwuru ka ndị na-azụ ahịa kwụọ ya bụ ụgwọ, kama na ọ bụ ndị na-ere ere ga-akwụ ya. Ọ sịkwa na ha kwere ndị na-ere ahịa nkwa na ha ga-agba mbọ ihu na ndị ụlọakụ dị iche iche napụtara ndị na-ere ahịa naịrịa iri ise bụ ego stampụ. Jimoh kwusiri ike na ""ego stamp"" abụghị ndị na-azụ ahịa kwesiri ịkwụ ya"". Ọgbakwara ama na Central bank agaghị akwụsịnwu ya bụ ego ""stamp"" maka na ọbụghị n'aka ha ka ọ dị. Ihe mere e ji nwụchie onyeomeiwu - Uweojii Ndị uweojii Legọs akọwala ihe mere ha nwuchie Shina Peller bụ onye omeiwu nwe ụlọ nkwari a kpọrọ 'Quilox club' dị na Legọs. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Bala Elkana sị na ọ bụ maka Shina Peller na ndị agboro wakporo ụlọ ndị uweojii dị na Maroko. Ha sị na ọ bụ maka kpachikpachi okporoụzọ mere site etu ndị bịara ịṅụ mmanya na Quilox ji dochie ụgbọala n'okporoụzọ Ozumba Mbadi. Ndị uweojii gara buru ụgbọala atọ ndị a sị kwụchiri ụzọ nke mere Shina Peller ji kpọrọ ndị agboro gawa n'ụlọ ndị uweojii. Orji Uzo Kanu na mkpọrọ ya Ụlọikpe ukwu dị na Legọs ajụla ịnabata arịrịo Orji Uzor Kalu rịọrọ ka a tọhapụ ya site n'ụlọmkpọrọ. Ọkaikpe Mohammed Liman sị ka Orji Uzor bụ aka chịburu Abia steeti nọrọ n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-atụle akwụkwọ ọ gbara. Ọkaikpe a jụrụ ihe mere Kalu ji gbapụ ọsọ tinye akwụkwọ a mgbe ụlọikpe mkpegharị achabibeghi ikpe nke mbụ ọ gbara. Cheta na Kalu site n'aka ndị ọkaiwu ya gbara akwụkwọ sị ka ụlọikpe tọhapụ maka na ahụ adịghị ya. E boro Kalu ebubo iri ego dị ijeri naịra asaa na ụma mgbe ọ na-achị dịka gọvanọ Abia steei bụ nke ikpe mara ya. Mmanya akụoyibo egbuola ihe ruru mmadụ asatọ Mmiri akụoyibo bụ ngwa kacha mkpa e ji emepụta mmanya lambanog Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla ka ha ṅụchara mmanya e ji mmiri akịoyibo nke a na-akpọ Lambanog mee, na mba Filipines. Ihe ruru mmadụ narị atọ ọzọ nọ n'ụlọọwgwụ ugbua anata ọgwụgwọ dị ka ha na-ekwuputa maka afọ mgbu na anya ajụ. 'Inwe kabal adịghị njọ' Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari, ekwuola na o nweghi ihe o mere ma e nwee 'Kabal' na-enyere Buhari aka n'ọchịchị. Shehu kwuru na gọọmentị niile dị n'ụwa nwere ụdịrị ndị ahụ, n'ihi na onyeisiala ọbụla ga-enwerịrị ndị na-adụ ya ọdụ nakwa ndị ọ tụkwasịrị obi. Gịnị ka a ga-eme ndị 'yahoo-yahoo'? Otu ngalaba na-arụ ọrụ na-efu ekwuola na ọ ga-aka mma inyere ndị anwụchiri maka igwu wayo nke a na-akpọ 'yahoo yahoo' na Bekee aka, kama ịtụ ha nga. Ngalaba 'VELMA Foundation' ahụ kwuru sị na ntaramahụhụ ahụ anaghị enyere ha aka, kama na ọ ga-aka mma ịhụ na onye ahụ chegharịrị n'ọrụ ọjọọ ahụ ma baara ọha uru. Onye ka Arteta ga-eji mepee akwụkwọ n'Arsenal? Mikel Arteta Kepu kepu si Arsenal apụta na-akọwa na Mikel Arteta ka malitere ịchịkọta Arsenal, amarala ndị ọhụrụ ọ chọrọ ịzụbata. Akụkọ na-ekwu na Arteta agbadola anya ebe Dries Mertens nke Napoli na Kevin Volland nke Bayer Levekusen nọ. Naịjirịa anaghị akwado mmegide okpukperechi - Lai Mohammed Gọọmentị etiti akatọọla aha ọjọọ mba Amerịka kpọrọ Naịjirịa nke ha sị so na mba ndị na-esonye maọbụ na-akwado mmegide mmadụ inwe okpukperechi masịrị ya. Lai Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, kwuru sị na aha ọjọọ a si n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji okpukperechi akatọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari. Iwu ọhụrụ ndị 'Central Bank of Nigeria' tinyere Ndị na-eweta ego ruru puku otu narị naịra nwereike ịkwụ ụgwọ karịa ugboro iri Ụlọakụ gị ga na-anazị gị naịra iri atọ na ise karịa iri isii na ise a na-ana ma i si n'igwe ATM na-abụghị nke ụlọakụ gị dọrọ ego. Nke a bụ makana ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN enyela ha iwu ka ha butuo ya ma wetukwaa aka n'ụfọdụ ụgwọ ndị ọzọ. Ọgụ chara n'ụlọmkpọrọ Ihe ruru ndị nga iri na isii anwụọla ka ọgụ chara n'etiti otu abụọ n'ime ụlọmkpọrọ El Porvenir dị na Tegucigalpa dị na mba Họnduras, na-erughi ụbọchị abụọ ọgụ dapụtara na mkpọrọ ọzọ. Ndị na-arụ na mkpọrọ ndị a sị na e ji ma egbe ma mma lụọ ọgụ a takwara isi mmadụ iri na asatọ n'ụbọchị Fraịde. Oge egwuregwu ndị Manchester City Guardiola bụ onye nchịkọta ha sị na o degaara Premier League akwụkwọ ozi iji sị ha 'daalụ' Ndị Manchester City na-ajụ ndị Premier League ajụjụ maka ntinye oge ha ga-eji agba asọmpi, dịka ha ga-agba asọmpi abụọ n'ime awa iri anọ na isii. Man City ga-ebu ụzọ zute Wolves n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa a, ma zutekwa Sheffield United n'ụbọchị iri abụọ na itoolu. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ndụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ" afirika-48862331,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48862331,Herders-farmers conflict: Ihe mere Gov Ikpeazu ji kwụọ ndị ọchịehi ụgwọ,Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na ihe mere o ji nye ndị ochi ehi ego bụ ka udo chịa n'Okpuru Ọchịchị Ụkwa-East dị na steeti ahụ.,"Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Nghọtahie dara n'etiti ndị ntorobia na ndị Fulani Ọchịehi na Ukwa -East nke mere ka ha gbuo otu ehi onye ọchịehi. Mana gọvanọ Ikpeazu site n'ozi si n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo n'ekwentị na ịkwụ ụgwọ ehi abụghị n'ihi egwu kama ọ bụ iji gbochie tigbuo-zogbuo n'etiti ndị mpaghara ahụ na ndị Fulani ọchiehi. Ihe onyonye pụtara na soshal midia gosiri ebe onye a kpọrọ Sam Nwogu n'aha gọvanọ Ikpeazu nyere otu onye Eze ego dị otu puku narị naịra na iri asa n'Ụkwa East. Ego a bụ nke Nwogu kwuru na o si n'aka gọvanọ bụ maka iji kwụọ ndị ọchiehi ụgwọ n'ehi ha ndị ntoroọbịa obodo ahụ gburu. Ndị nọ n'obieze mgbe nke a mere gụnyekwara onyeisioche okpuruọchịchị Ụkwa East bụ O. C Nwanuo. Onye Eze were ego a nyefee onye na-anọchite anya ndị ọchịehi n'aka ma gwa ya ka ọ dọọ ndị nke ya aka na ntị ka ha ghara imebi ọrụụgbo ndị obodo ọzọ. Agwa a gọvanọ kpara butere nkatọ si n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ ndị kwuru na ọ na-akwado ndị ọchịehi n'Abia Steeti. Odeakwụkwọ Mgbasaozi Abia State. Mana Ememanka kwuru na ego a gọvanọ Ikpeazu nyere bụ iji mezuo nkwa o kwere n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo maka ime udo n'Abia Steeti. O kwuru na ọ bụghị maka ịtụ egwu kama na ọ bụ ka udo dị n'etiti ndị obodo ahụ na ndị ọchịehi. N'okwu ya ""Kama a ga-ekwe n'ihi ehi gbuo mmadụ, nye ndị a ego a ka ha gawa."" ""Ọ bụghị n'ihi ịtụ ụjọ, kama ọ bụ amamihe ka e ji achị steeti."" Akụkọ dị ga-amasị gị:" afirika-43384497,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43384497,Onyeara egbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Ogun steeti,Ilu Igbo kwuru na ndị ọrụaka ụgbọala (mekanik) ekweghị mmadụ mara onye isi dị nma na onye isi mebiri emebi.,"Naịjirịa enweghị otụtụ ụlọogwụ na-agwọ ndị nwere ọrịa isi mgbaka Ilu nke a na-abia ka otu onyeara akpọrọ Lekan Adebisi gara n'otu ụlọakwụkwọ akpọrọ St John's Anglican Primary School Agodo dị n'Ogun steeti gbuo ụmụakwụkwọ abụọ. Aha ụmụaka abụọ ahụ bụ Mubarak Kalesowo na Sunday Obituyi. Ha abuọ dị afọ anọ, nọcha na klasị ọtaakara. Akụkọ kwuru na onyeara a batara n'ụlọakwụkwọ a mgbe ụmụaka na-aga egwuregwu, wee kpaa mkpamkpa a. Ugbua, onweghị onye mara ebe Adebisi nọ maka na ọ gbara ọsọ oge ọ magburu ụmụakwụkwọ a. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ndị uweojii na-achọ ya achọ n'ebe niile ugbua. O kwukwara na ndị uweojii agaala n'ụlọakwụkwọ ihe mberede a mere maka ime ka udo laghachịta. Gịnị ka ha ga-eme Adebisi? Ihe kachasị ndị uweojii mkpa ugbua bụ ijide ya n'aka. Oyeyemi kwuru na ndị uweojii anaghị akpọ Adebisi 'ogbummadu' ugbua maka na ha ka na-achọ ịchọpụta ihe mere o jiri kpaa mkpamkpa a n'isi mbido. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43041351,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43041351,South Africa: ANC 'si na Zuma ga ala',"Onye ode akwụkwọ ANC bụ Ace Magashule sị na nkwekọrita ndị pati ha nwere ""e wepụ Zuma n'ọkwa"" bu nke ha rụtere ka ha kpachara nnukwu nkata.","Mana, Mgashule si na ha ekpebibeghị mgbe Zuma ga apụ, na ekwukwa na ha ekweghị n'ihe Zuma sị, nke bu ka enye ya ọnwa atọ ma ọbụ isii ka o ji pụọ. Okwu Mgashule danyere na nke ndị nta akụkọ na Saut Afịrịka kwuru n'ụtụtụ taa. Akukọ a akọro maka ""ikpọghachi"" Zuma soro nkata dị icheiche ndị onu na atụ nkụ na ANC na Zuma nwere kemgbe ụnyahụ. Ya bụrụ na Zuma, di afọ 75, ekweghị ịpụ, a ga eme ntule aka a ga eji chụpụ ya. Zuma nọ n'ọkwa kemgbe afọ 2009, mana ebubo mpụ nọ n'eso ya. ANC ekwugbeghị ọzọ ha chọrọ iso, mana ndị ma ihe n'aga na pati ahụ kọwarụ ndị nta akụkọ na Saut Afịrịka nakwa Reuters. Zuma ekweghị kemgbe Decemba a na asị ya rituo. Ọ na Decemba ka Cyril Ramaphosa nọchiri ya ka onyeisi ANC. Amabeghi etu Zuma ga eji sa aririo a na ario ya ka ọpụọ. A ga ezigara ya akwụkwọ taa. N'ọnụ ụtụtụ taa, Ramaphosa rapụrụ ebe a na-eme nzụkọ ANC gawa be Zuma, ebe a sị na ọ gwara onyeisiala na aga achupu ha ma yabụrụ na ojighi aka ya rituo. Ramaphosa mechara lahachi ebe ANC na eme nzụkọ." afirika-45401831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45401831,Restructuring: Osinbajo kwuru na Atiku ghọtahiere ya,"N'ime akwụkwọ ozi ọ degara ụlọọrụ ntaakụkọ Premium Times , Osinbajo kọwara ihe ndị ọ mere gosiri na ọ kwadoro nhazi obodo pụtara 'Restructuring' na bekee.","'I tinye anya na mpụ kachasị mkpa' Ọ kwukwara na Atiku katọrọ ya maka na o kwuru na ""Restructuring' agaghị akwụsị nsogbu ndị anyị nwere n'ala Naịjirịa"" mana ihe o bụ n'uche wee kwu ya bụ na ekwesiri ị mata ihe mere steeti ejighi eme ọfụma karịa ịbu nhazi obodo n'isi. O kwuru na ihe ekwesiri ịtinye anya n'aya ugbua bụ mpụ ego n'arị ibe ya elu mbụ nke pụtara na ndị mmadụ na-aga n'akpa ego ala Naịjirịa ewere ego etu ọ sị sọ ha. N'ọnụ ya ""nhazi obodo agaghị enwe isi maọbụrụ na ndị nọ n'ọchịchị ka na-eme akpaego Naịjirịa ka akpaego nke ha. Restructuring bụ nhazi obodo bụ okwu ndị ọchịchị ndịIgbo kpụ n'ọnụ kemgbe Ndị tinyere ọnụ na ya bụ okwu gụnyere Obi n'achị Ọnịcha, Mao Ohabunwa bụ onye omeiwu nakwa Ugo Egbujo bụ onye ọkaiwu. Lee ihe ha kwuru ebe a. Restructuring: Okwu a ka na-agbawoju anya - Ikenga Nnewi Onyeisiala Naịjirịa dị Igbo nso karịa 'restructuring'- Osita Okechukwu 'Restructuring' ka mma karịa referadum Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-43361966,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43361966,Serena na Venus Williams ga-asọmpi n'Indian Wells,Onye a ma ama n'asọmpi tenis na mbaụwa bụ Serena Williams na nwanne ya nwaanyị Venus ga-apịa n'agba nke atọ na Indian Wells.,"Serena na Venus Williams ga-ezukọ n'asọmpi nke nrite nke 29 Nke a bụ dịka Serena laghachitara kamgbe ọnwa iri na anọ ọ pụrụ ịga mụọ nwa ya nwaanyị. Serena agbaghị tenis n'ọnwa 14 ndị ahụ, mana o meriri Kiki Bertens bụ onye Nedaland 7-6 (7-5) 7-5 n'agba nke abụọ ha. ""Ihe niile bụ nrite,"" Serena kwuru ka o nwere mmeri n'ime otu elekere na nkeji 52. Nwanne abụọ a zutere n'ikpeazu n'afọ 2017 mgbe ha gbara na mgbacha Australian Open bụ mgbe Serena ritere iko Grand Slam nke iri abụọ na atọ ya. Mgbe o meriri Venus na Melbourne, Serena di ime ada ya bụ Alexis Olympia nke ọ mụrụ n'ụbọchị mbụ nke Septemba 2017. Asọmpi a ga-abụ nke ugboro 29 ụmụnne a ga-ezụkọ n'asọmpi nrite. Serena meriri ugbo 17 n'ime ugbo 28 ha gbabugoro. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43447110,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43447110,Nwoke ekpebịela na ya agaghi alụzi nwanne ya,Chiadikobi Ezeibekwe bụ nwoke lụrụ nwanne ya nwannyi ekwuola na ya na ya anọghịzị.,Chiadikobi siri na ọ bụ akwụkwọ nnsọ uka ya nyere ya ikike ịnụ nwanne ya Ezeibekwe bụ onye nkuzi nke ọnụọgụgụ n'obodo ha kwuru na nke a ebe ndị okorobịa n'obodo ha na-akwado ị chụpụ ya na ezinaụlọ ya n'obodo ahụ. O kwuru na ya ga-esekọrọ aka n'ihe niile ọ na-eme gbasara ị lụ nwanne ya nwaanyị dị afọ 17. Onye ụkọchukwu ndị ụka Katọlịk n'obodo ahụ bụ Ignatius Onwuatuegwu kwuru na a ga-achụ aja dịka e kwuru na-akwụkwọ nsọ ijii gbaluọ arụ Chiadikobi mere. Ọ dị ka Ezeibekwe a na-ewe sa ọtụtụ mmadụ iwe ebe ọ sị na 'ị gbalụ arụ a apụtyaghị na m ga-alaghachị ụka Katọlịk'. Akụkọ pụtara na-ekwu na Ezeibekwe bụ bụ onye nsọ ndị ụka Katọlịk oge gara a ga. Ọlụrụ ya na nwanne ya lụrụ butere ezigbote ọgbaghara na Ekwulobia nke mere ka agba ụlọuka ha nọ me omume agbam Akwukwọ a ọkụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-46078410,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46078410,Buhari: Ihe ndigbo chọrọ ịgwa onyeisiala ma ha zute ya,Nyocha BBC Igbo mere ndị na-eso ha na Facebook gosiri na ụfọdụ ndị Igbo achọghị iji ntị anụ maka onyeisiala Muhammadu Buhari.,"Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ihe ga-aka eme ha obi aṅụrị bụ ma Buhari gbanwee ọchịchọ obi ya bụ ịchị Naịjirịa ọzọ bido n'afọ 2019, laa ezumike nka. BBC Igbo jụrụ sị ""Ọbụrụ na ị nwere ohere ịgwa Buhari otu ihe, gịnị ka ị ga-agwa ya?"" ihe karịrị mmadụ 100 tinyere ọnụ n'okwu ahụ na Facebook. Ihe ha kwuru 1) Ndị chọrọ ka ọ rụọ ọrụ: Humble Stonecoated Roof chọrọ ka ọ rụọ ihe ndị e kwesịrị ịrụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ. George Onyebuchi kwuru sị ""M nwee ohere ịgwa ya okwu, m ga-agwa ya ka o lerutu anya n'ụzọ dịgasị n'ala Igbo. Ụzọ dị na South East ekwerọzị ọgịga. Ndị ọrụ ya niile bụ naanị ndị Awụsa, ka o lerutu anya na ""federal character"" ma ọ na-ewe ndị ọrụ ya."" Goodness Ezeh kwuru sị ""Ihe m ga-agwa ya bụ, ka O jiri ike ya dịka onyeisi ọchịchị ala anyị, rụọ ọrụ ka ụkọ nri, ihe isiike, nakwa ogbugbu a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ n'akụkụ dị icheiche n'ala anyị kwụsị, onye ọbụla aka ya dị n'igbu mmadụ ibe ya, ka a kpụpụ ya ụlọikpe."" 2) Ndị chọrọ ka o zuo ike: Otu onye bụ Felix Ejeagba, kwuru sị na ọ ga-agwa Buhari ka ọ gaa zuo ike. Azubuike Chijioke kwuru sị ""Ihe m ga-agwa ya bụ na ọ ga-ahapụ ọchịchị nke ugboro abụọ ya, ka ndị ọzọ chịa."" Marc Riz Powertools kwuru sị ""Otu ihe m ga-agwa ya bụ ya rituo n'oche prezidenti."" 3) Ndị chọrọ ịjụ maka asambodo ya: Yugo Ahaiwe sị na ọ ga-ajụ ya ihe gbasara asambodo ule WAEC ya. Onye ọzọ chọrọ ịma maka asambodo ya bụ Emeka Ezejah kwuru sị ""M ga-ajụ ya etu esi meere ya asambodo ọhụrụ ebe o kwuru na nke ochie ya nwere dị n'ebe ndị agha obodo anyị nọ, ka ọ bụ na o kwuchara sị na ya ekwurọzị? Ndukaku De Chemist sịkwa na ọ ga-ajụ ya ""Kedụ otu ị si dee ule WASC n'afọ 1961 ma weta akara n'afọ 2018, ma foto ya egosighi afọ ole ọ dị na 1961? 4) Ndị chọrọ ka o nye ha Biafra: Onyia Fabian Nnamdi kwuru sị ka Buhari nye ndị chọrọ Biafra nnwereonwe. Stephen Okike kwuru sị ""Agam agwa ya ka ọ hapụ Biafra ka ha nwere onwe ya."" Gụọ ihe ndị ọzọ kwuru na soshal midia ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48585272,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48585272,Nigeria vs South Korea: Falcons achakeela ka ugo,Ọgbọ egwuregwu Fransị enwurula ọkụ ugbua dịka Falcons nke Naịjirịa tuuru ugo.,"Goolu mbụ Naịjirịa si n'aka ndị Sawụt Korea mgbe Kim Do-yeon gbabara bọọlụ na neetị ha na nkeji 29. Gọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Nke a mere na amalitere nyocha site na Teknụzụ VAR tupu anabata goolu ahụ. Asisat Oshoala gosiri ndị Sawụt Koria na Naịjirịa abịaghị egwuregwu ụmụaka na nkeji 75. O ji otu ọkpụ goolu saa ha anya nke mere na Naịjirịa meriri asọmpị ahụ. N'ikpeazụ, Naịjirịa ji mmeri a gbara isi onwe dịka Norway merichara ha n'asọmpị nke mbụ ha." afirika-50259679,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259679,Nnamdi Kanu: Ohere adị ka nwa amadị a laghachite Naịjirịa?,"Ọ tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya mgbe ọkaiwu Nnmadị Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka ha weghachite iwu ha nyere ka ahapụ Nnamdị Kanu n'aka ebe nke Bekee na-akpọ ""bail"".","Cheta na Kanu mejọrọ iwu e ji tụghapụ ya mgbe ọ gbara ihe ọkpọrọ ọsọ ndụ n'afọ 2017. Ọ bụ atụmatụ ahụ ka Maazị Ejiofor jiri rịọ arịrịọ a mana Ọkaikpe Binta Nyako, bụ onye nyeburu ohere ntọghapụ aka ebe a, kpọrọ isiekwenkụ na ya agaghị enyekwa ohere a ọzọ. Ma kwukwa na etu obodo si kwụrụ ugbua, ọ bụ mkpọrọ ga-akara Maazị Kanu mma maka nchekwa ndụ ya. Mana, ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ ihe mere Ọkaiwu Ejiofor ji arịọ ụdịrị arịrịọ a, ọkachasị etinye uche n'ọnọdụ o jiri hapụ Naịjirịa. Kepu kepu nlọta Maazị Kanu malitere mgbe ozi pụtara na nne ya bụ Ugoeze Nnenne Kanu alala mmụọ. Dịka usoro omenala Igbo ji kwụrụ, nwa kwesiri ịkwa nne na nna ya. Ọzọ bụkwa na Igbo na-achọkarị ili mmadụ na obodo ya. Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere Nke pụtara na ụfọdụ na-eche na a ga-ebulata ozu nne Kanu, ọkachasị etu a ọ bụ Ugoeze. Kanu bụ onye aha ya ka ada ụda karịa n'ezinaụlọ ha, nke mere na ọ ga-abu onye ọtụtu mmadu ga-eji maka ya bịa akwamozu nne ya. Kepu kepu a rikwara elu mgbe akụkọ pụtara na ụfọdụ ndị Eze si Abia steeti rịọrọ gọọmentị ka e nye Kanu ohere ka ọ lọta bịa lie nne ya. Agbanyeghi na Maazị Kanu katọọrọ atụmatụ a, ajụjụ ndị mmadu were bụrụ ma Nnamdi Kanu ọ ga alọta bia lie nne ya? Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Epụrel nke 2019, Maazị Kanu sị na ya ""na-alọta n'ike na-ebube"". Kedu ebe gọọmentị Naịjirịa kwu? Ịmata nke nwereike ime, BBC Igbo gbara gọọmentị Naịjirịa ajụjụ ịmata ebumnuche ha maka nlọta Kanu. Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina sị na ọ bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed nwere ikike ịza ajụjụ a. Ekwentị Maazị Mohammed n'onwe ya tigidere mkpu mana ọ zaghị BBC Igbo. Ebe ka Kanu kwụ? Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor n'onwe ya si ka akpọghachị ya n'ime ugboro ugboro BBC Igbo kpọrọ ya. Mana, n'arịrịọ ọ rịọrọ ụlọikpe, Nnamdị Kanu, site n'aka Ejiofor, na-ajụ gọọmentị Naijirịa ma ọ ga-echekwa ndụ ya ma ọ lọta dịka ha napụrụ ya ikike ịgbapụta onwe ya. Nke a mere Ọkaikpe Binta jiri saa okwu ọ sara. Kanu na onwe ya sara Ọkaikpe Nyako n'akara Twitter ya sị ka ya na ezinaụlọ ya gwara gawa ụlọ mkpọrọ iji gbanarụ ntọrọ. BBC jụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu maka etu okwu a siri kwụrụ ugbua. Chidiebere Ike bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo tinyere ọnụ n'ọkwu a ka BBC gbara ya ajụjụ. Maazị Ike sị na gọọmentị Naijirịa anaghị erubere ụloikpe isi nke mere na ụjọ kwesiri ịtụ Nnamdi Kanu. Ọ sị na ọ bụ onyeisiala ka ọ dịrị ihu na ndị mmadụ kwanyere ụlọikpe ụgwụ na nsọpụru dịrị ya. Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya O kwuru na ọ bụghị iwu na Nnamdị Kanu kwesiri ịlọta maka olili nne ya. Maazị Ike kwuru na n'ụche ya, na Nnamdi Kanu agbaghị ọsọ kama na ọ bụ gọomentị Naijirịa chụrụ ya ọsọ. Ọ tụrụ arọ ka Kanu nọrọ ebe ọ nọ ka oge na-aga. Ọtụtụ ụmụ afọ Naịjirịa tinyere ọnụ na-ajụjụ BBC Igbo jụrụ banyere okwu a kwukwara dịka Maazị Ike. Ka ọ kwụ ugbua, Ọkaikpe Nyako ekwuola ka ulọikpe ya kwụ, ebe okwe dịzị bụ n'ọgbọ Ifeanyi Ejiofor na onye ọ na-anọchite anya bụ Maazị Nnamdi Kanu. Kanu na onwe ya kwuru na ọ bụ ""ịnweta Biafra"" ka ya mkpa mgbe BBC Igbo jụrụ ya na mkparita uka emere n'afọ 2019 ma ọ ga-anabata ohere ya na gọọmentị Naịjirịa ikpezi. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ" afirika-55082675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55082675,Nnamdi Kanu: Ebugharịala ikpe ya,Ọkaikpe Binta Nyako bughariri ikpe ọ na-ekpe onyeisi otu na-achọ mmwereonwe Biafra a kpọrọ Indegenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ikpe banyere ebubo na ọ kpara nkata imegide mba ahụ ga Jenụwarị 27 nke afọ 2021.,"Nke a na-abị ka Ọkaijpe nyako kpebiri na ya agaghị eji maka Maazị Kanu anọghị na Naịjirịa were gbanyụọ ọkụ n'ikpe ọ na-ekpe. Ọ bụ n'afọ 2017 ka Nyako nyere Kanu ohere ịla ụlọ ya ma siri ebe ahụ na-abịa ikpe. E nyere ohere a dịka Nyako kwenyere na Kanu kwesiri ịga nata ọgwụgwọ dịka ọ nọtere aka na mkpọrọ. Ọ bụ Ọkaiwu KC Ejiofor nọchitere anya Kanu n'ulọikpe. Ọ gwara ụlọikpe na ọ bụ gọọmentị na-adọghachi ikpe a azụ. Ọkaiwu na-anọchite anya gọọmentị kwenyere na nke a bu eziokwu, ma kwukwa na ha agwaala ụlọikpe ihe kpatara ya. Ọkaikpe Nyako sị ka osirila dịrị, ikpoe ga-aga n'ihu na Jenụwarị 2021. Ka ikpe malitere Ọkaiwu nọchitere anya ndị Ipob bụ KC Ejiofor kwuru na Bright Chimezie bụkwa onye kwesiri ịbịa ikpe taa amataghi maka ya bụ ikpe makana ọ nọ n'ime obodo ebe tecknuzu ekwentị adịghị. ọkaikpe Nyako nyere iwu ka ejiri ekwenti zie Maazị Chimezie na ndị ọzọ ozi ka ha ghara isi na ya enweteghị ozi ya. Ọkaikpe Nyako kagburu ohere ahụ onyere ma nye iwu ka anwụchie Kanu ebe ọbụla a hụrụ ya na Naịjirịa. Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor sị na ihe mere o jighi bịa ikpe dịka o si kwesi esighi ya n'aka. Ọ sị na ọsọ Kanu gbara bụ makana ndị agha wakporo ụlọ ya di na Afara Ukwu dị n'Abia steeti, ma kwukwa na ọ bụ ihe a kpatara Kanu jiri gbaa ọsọ ndụ. Ejiofor sị ụlọikpe weghachi ohere ahụ ha nyere ka Kanu siri na ulọ ya abịa ikpe, nke ga enye ya ohere ịlọghachite Naịjirịa bịa zara ọnụ ya. Kanu n'onwe ya na-ekwu na mkpebi Ọkaikpe Binta Nyako achịtaghị aja maka e mere ya iji pịchị ya na Ipob ọnụ. Ndị narala Kanu akaebe Ntọghapụ Kanu bịara na mmezu dịka Sinetọ Enyinnaya Abaribe na ndi ọzọ ji otu nde narị naịra gbara ya akaebe. Ndị bụ Tochukwu Uchendu nakwa Ụkọchukwu Jeu bụ Ben El-Shalom. Ọkaikpe Nyako sịbụ ka ndị nye ụlọikpe ego ahụ jiri gbara Nnamdi Kanu akaebe makana ha kpọghị ya bịa ụlọikpe dịka he siri kwee nkwa. Ebe okwu siri malite Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2015 ka gọọmentị Naịjirịa nwuchiri Nnamdi Kanu na Legọs dịka o si mba Briten bata. Gọọmentị Naịjirịa boro ya ebubo na ọ na-agba Naịjirịa mgba okpuru site na Redio Biafra ọ nọ n'isi ya. Kanu mechara nọrọ na mkprọrọ ọnwa iri na asatọ na nga dị na Kuje. Tupu a kpọchie ya n'ụlọ mkpọrọ, Kanu nọ n'aka ngalaba a kpọrọ Department of State Services (DSS) ruo Janụwarị 2016 bụ oge ụlọikpe sị ka akpọrọ ya gawa nga. Ọ bụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Eprelụ 2017 ka Kanu pụtara na mkpọrọ dịka o mezuru ihe Ọkaikpe Binta Nyako kwuru iji nwe ohere ka siri ebe ahụ na-abịa ikpe. Nnamdi Kanu: Ihe mere m ji akatọ ụfọdụ ndị ọchịchị n'ala Igbo Ndị anwụchiri ha na Kanu Maazị Bright Chimezie, Chidiebere Onwudiwe, David Nwawuisdi na Benjamin Madubugwu bụ ndị anwụchiri ha na Kanu. Ebubo gọọmentị boro ha bụ na so kpaa nkata ịgba Naịjirịa mgba okpuru nakwa iji egbe na-enweghi ikike ya. Ọ nde narị iri n'isi otu onye ka Ọkaikpe Binta Nyako mara ha iji tụghapụ ha n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun 2018. Ọkaikpe Nyako machikwara ndị a ị ga njem n'ofesi. N'ụbọchị 20 nke ọnwa Febụwarị 2018, Ọkaikpe Nyako wepụrụ ndị a n'ime Nnamdi Kanụ, dịka ọ sị na ikpe nke ha kwesiri ịkwụrụ iche maka ahụghị Kanu anya. Ọkaikpe Binta Nyako nyere Nnamdi Kanu ohere isi be ya n'abịa ikpe n'afọ 2017 Mkpebi ịmalite ikpe a ọzọ Ọ bụ n'ọnwa Maachị 2019 ka Ọkaikpe Nyako kpebiri ịchabị ohere ahụ o nyere ndị Kanu ka ọ na-esi be ya abịa ikpe. N'ụbọchị ahụ, Ọkaikpe Nyako nyekwara iwu ka anwụchie Maazị Kanu ebe ọbụla a hụrụ ya. Ebe Kanu kwụ banyere ikpe a Mmụ na Nnamdi Kanu ahụbeghị anya Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere 'afo 2019, Maazị Kanụ sị n'ọsọ ya gbara bụ makana ""ndị agha bịara Naịjirịa igbu"" ya. Ọ sịkwa na ya dị njikere ịbata bịa zara ọnu ya, mana ọ si na-ekweeiri ime ihe etu ọ ga-esi kwụrụ ọtọ. Ọkaiwu ya bụ Ejiofor n'onwe ya rịọrọ ụlọikpe ka o tinyekwa ohere ahụ enyere Kanu ka o si be ya na-abịa ụlọikpe, nke ga-enye ya ohere ịbịa Naịjirịa maka ikpe a. Ka ọkwụ ugbua, iwu Ọkaikpe Nyako nyere ka anwụchie Kanu ka dị." afirika-47188816,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47188816,Nigeria Election 2019: Ọkụ agbaala ụlọ ntuliaka na Plateau steeti,Otu ụlọ ebe a na-akwado ime ntuliaka alaala n'ọkụ gbara ya taa.,"Dịka akụkọ siri kwuo, ọkụ ahụ repịara ihe niile dị n'ime ụlọ ahụ gụnyere akpati akwụkwọ vootu nakwa akwụkwọ vootu dị icheiche. Onye ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ihe a awụnyela aja na nkwado ntuliaka mana o rubeghi ịme nyocha gbasara ịrụka ntuliaka na abịa. Maka Leah Sharibu: Nne Leah Sharibu bụ otu nwa agbọghọ ka tọrọ n'aka ndị Boko Haram ka ha wakpochara obodo Dapchi n'afo gara aga, ezigarala gọọmentị ozi ka ha mezuo nkwa ha kwere ịnapụtara ya nwa ya. Ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abụja na nwa ya ka nọ n'aka ndị oji isi aghọ mgbọ a makana o kweghị esonye ha n'ofufe ha. N'akụkọ si mba ofesi, Ngalaba United Nations kwuru sị na otu ụgbọelu helịkọpta nke ndị agha mba Itiopịa kpọkasịrị n'ogige ụlọọrụ UN nke dị Na mpaghara Abyei dị n'etiti mba Sudan nakwa Saụt Sudan. Ihe mberede ụgbọelu ahụ gburu mmadụ atọ, mana o dobeghi anya ihe mere o ji kpọkasịa. N'egwuregwu, Otu Tottenham zuru ike n'ahụ ndị Leicester City ka ha ji ọkpụ atọ a satara otu merie ha mgbe ha zutere na Premier League. N'aka ọzọ, ndị na-akwado ndị Chelsea nakwa Man City, chị aka n'obi na-eche ihe ha ga-agbata ma e gbuzuo bọọlụ taa. Ndị agha na ndị Biafra: Ndị agha Naịjirịa nke Division 82 n'akpagharị n'Abia steeti agọọla ebubo na ha gbara egbe ma gbuo otu onye na steeti ahụ. Ha gọnarịrị na onweghị onye otu ha, ha dunyere ka o sogharịwa onye chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu. Mana ha kwetara na ha nwụchịrị ndị otu Ipob isii ghara ha nye n'aka ndị uweojii nọ na steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Musa Sagir kwuru na ọ bụ maka iweta udo na iwezuga ọdachi ka ha ji wuchie mgbe ndị otu Ipob na-eme ngagharịwe. N'akụkọ ọzọ, E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015 Ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ntuliaka na Naịjirịa akpọrọ Inec n'ịchafụ ekwuola na ọ ga-ajụ aha ndị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị na-emeghị ihe ndị iwu kwadoro dịka a na-atụ anya n'aka ndị nnọchiteanya pati di iche iche tupu amalite ntuliaka. A wakporo ụfọdụ ndị nkwado PDP n'Abuja Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'okpuru PDP kwuputara nke a site n'akara Twitter ya. Ọ rịọkwara mmadụ niile ha gbalahụ nsogbu na ọgbaghara n'oge a. N'ofesi, Ihe mberede a achụpụla mmadụ ruru puku atọ na be ha Ebupula mmadụ puku kwuru puku na mba New Zealand dịka ndị ọrụ mmeyụ ọkụ na-agba mbọ ịhụ na oke ọkụ bidoro n'ụfọdụ obodo na mba ahụ kwụsịrị kpam kpam. Oke ọkụ a malitere kamgbe abalị isii na-akwado ibanye obodo ọzọ dị n'akụkụ ya. Etinyela ọnọdụ gbata gbata, ebe mmadụ ruru puku atọ agbapụla na be ha maka ihe mberede a. Ọkụ a bụ ọkachasị kamgbe afọ 1955. N'Egwuregwu Otu Egwuregwu bọọlụ Mancity na Chelsea ga-akwata ya na mgbede taa bụ Febụwarị iri n'asọmpị Premier league. Soro anyị na bbc.com/Igbo ka ị chọpụta onye ike ga-agwụ makana anyị ga-agwa ụnụ ka o si gaa. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ụmụ Igbo agaghị aza oku ịhapụ ime ntuliaka Ipob kpọrọ- Ohaneze" afirika-47684900,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684900,Father Clement Ugwu: 'Ndị ụka Kristi enweghi olileanya na nchekwa Naịjirịa' - Bishop Odedeji,Bishop ndị ụka Anglịkan na mpaghara ọdịda anyanwụ Legọs bụ James Olushola Odedeji akatọọla ọnwụ Fr. Clement Ugwu.,"O kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ nke mere na ndị ụka kristi enweghizi olileanya na nchekwa ala Naịjirịa. O kwuru nke a mgbe ọ gara ụka mmamma a tụrụ maka ụkọchukwu nọ n'okpuru ya nwunye ya gbalahụrụ ọnwụ site n'ihe mberede ụgbọala. Ụkọchukwu Umeh biara ịtụ mmamma maka etu chukwu si napụta ndị be ya n'aka ọnwụ. O kwukwara na ọ dị mwute na o nweghi ihe ndị ọchịchị na-eme gbasara oke mwakpo, ntọrọ nakwa ohi na-arị ibe ya elu na Naịjirịa. ""Ndị ụkọchukwu dị ka ndị ọrụ enyemaka, ha ekwesighi ịgabiga ụdịrị ihe ọjọọ a"" ka ọ gwara BBC Igbo. Cheta na ndị ntọ gburu Clement Ugwu n'Enugwu n'agbanyeghi na ezinaụlọ ya na-akwụ ego mgbapụta ha sị ha kwụọ. Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-43529351,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43529351,Ndị mmadụ ebe dị ịcheịche na-echeta ụka ọmụ taa,Ndi otuchristi na uwa nile gbaa gburu gburu na eme emume uka ọmụ taa.,"Ụka ọmụ bụ emume emere taa n'ụwa niile Ha ji ya bụ emume echeta mmemme emere na akwụkwọ nsọ mgbe Jesu Christi jiri mmeri wee banye na Jerusalem ebe ụmụ Israel jiri igu na ọmụ wee tooro ya na-ala. Na uka ọmụ akara na ututu tata na Saint Michaels Parish Asata Enugu, onye Isi nchu aja bụ Rev fr. Callistus Ani kwuru na ahụhụ n'ọnwụ Jeso nwụrụ na enuobe kwesiri ikuzuri onye otuchristi ọbụla na ume ala dị mkpa na ndụ ha, na ọ bụ site n'inwe ume ala ka Jeso Christi jiri merie ọnwụ wee binie n'ọnwụ. ""Ṅomie nụ Kraist"" ndị nso Kraist kara ụka ọmụ taa Ụka ọmụ bụ nke na abịa otu izu ụka tupu emee mmemme ụka Easter. Nsukka Bishop nke Catholic na elekọta Nsukka diocese bụ Godfrey Onah agwala ndị Naijiria ka ha ñomie ume ala Jeso nwere nke mere ka ọ nwụọ ọnwụ na elu obe dịka ana eme emume uka ọmụ tata Onah duru ndị ụka ji ọmụ na obu ha gbagharịa na gburugburu St Theresa's Cathedral Nsukka iji cheta ụbọchị ụmụ Israel tọrọ Jeso ọmụ ka ọ na agbata Jerusalem. Akụkọ ga-amasị gị: A nwụchiela Bishọp ụka Katọlik maka imefu ego ụka Okpalaeke etinyela akwụkwọ arụkwaghịm Napụnụ ndị ọchị-ehi egbe -Obidigbo" afirika-45722120,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45722120,Gịnị na-ebute oke ọkụ ọgbụgba na Tanka?,Legọs bụ otu steeti dị na Naịjirịa ebe ọkụ na-agba tanka oge ọbụla.,"Ọtụtụ ụgbọala agbaala ọkụ na Legos maka ụgbọala bụrụ mmanụ ụgbọala Ọtụtụ oge ọ bụ tanka bu mmanụ ụgbọala bụ ihe na-akpata ọkụ ọgbụgba a . Cheta n'ime ọnwa Juun nke afọ a, nnukwu ọkụ gbara n'ebe akpọrọ Otedola na Legọs steeti ebe mmanụ kariri iri na abụọ nwụrụ nakwa ụgbọala kariri iri anọ na ise gbara ọkụ na yabụ ọkụ. Ọkụ a gbara maka ụgbọala bu mmanụ ụgbọala na-ehi mmanụ n'okporo ụzọ ahụ. Oge ọkụ okporoụzọ Otedola mere ọtụtụ mmadụ na ụgbọala na-aga na-ebe ahụ Nnukwu ọkụ ọzọ gbara na Festac n'ọnwa December n'afọ 2017. N'ime mberede a, ụgbọala kariri iri abụọ repiara mana onweghị onye nwụrụ na yabụ mberede. Ihe na-ebute ọkụ ọgbụgba Ibrahim Balogun bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ụgbọala gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe na-ebute ọkụ ọgbụgba n'ụgbọala buru mmanụ ụgbọala. Tanka gbochiri ọtụtụ okporoụzọ na Legọs ugbua O kwuru na ọtụtụ ndị a na-anya ụgbọala a adịghị elekọta ụgbọala ha nke ọma. Ọ kọwara na ọ oge taya moto gba, ụdi ya na-adọnye ọkụ na mmanụ ụgbọala ebu na gwongworo. O kwukwara na mmanụ ụgbọala na-eme ka igwe ta nchara. Balogun kwuru na: ""Ihe a mere ka ọtụtụ ihe onyonyo na social media na-egosi ebe ọtụtụ tanka na-ehi mmanụ n'ụzọ."" O kwukwara na ọtụtụ okporo ụzọ na Legọs adịghị mma. ""Ihe a na-eme ka tanka na-ada oge ọbula"" Ọkụ gbara na Legọs Nnukwu ọkụ gbara ụgbọala di iche iche ruru itoolu n'okporoụzọ Lagos-Badagry expressway n'ụbọchị abụọ n'ime ọnwa Ọktoba. Ọkụ a na-agbawa obi makana ọtutụ mmadụ na-anwụ n'ime ya N'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchiri ndị ụweojii na Legos steeti bụ CSP Chike Oti zipụrụ ndị ntaakụkọ, ọ kọwara na ndị hụrụ ihe mere kwuru na mberede a mere n'isi ụtụtụ. Ndị uweojii na-ekwu kwa na onweghị ọnyeọbụla nwụrụ na mberede a makana onweghị ụgbọala buru mmanụ ụgbọala dị nso na-ebe ihe a mere. Ha kọwakwara na ụbọchị oktoba 1, a hụrụ otu ụgbọala na-ehi mmanụ ụgbọala n'okporo ụzọ a, mana agbara mbọ hụ na ha kwụsị yabụ ohi hi mmanụ. Oti kwuru na onyeisi ndị ụweojii nke Legọs enyeela mkpebi ka ngalaba na-enyocha ihe kpara mberede ọbụla na steeti ahụ chọpụtara ihe kpara ọkụ a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54752162,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54752162,Mkpu akwa ka na-ada n'Awgu n'ihi ụgbọala gburu mmadụ 21 gụnyere ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha,Ụbọchị wenezde 28th October bụ ụbọchị ndị Awgu n'Enugwu steeti agaghị echefu ọsịsọ.,"Ndị ihe mberede okporoụzọ Awgu metụtara ekuputela okwu maka ya Ọ bụ n'ehihe ụbọchị ahụ ka ụgbọala 608 bu ụmụakwụkwọ Presentation nursery and primary school dị n'Awgu ala n'ụlọ ha, na ụgbọala a na-akpọ ""Low bed"" eji ebu 'bulldozer' kụkọrọ isi n'ebe a na-akpọ Nkwo dị nso ụlọọrụ okpuruọchịchị ha. Ya bụ Low bed kụbara 608 ahụ na mmiri Nkwo ahụ ma sorokwa ya dakpuo n'ime ebe ahụ. Dịka onye isi ndị na-ahụ maka ọdịmma okporoụzọ (Federal Road Safety Corps - FRSC) n'Enugwu steeti bụ Mazi Ogbonna Kalu siri kwuo, mmadụ 21 nwụrụ anwụ pịị ozugbo, nke gunyere ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi ha nakwa ọkwọụgbọala ụmụakwụkwọ ahụ. Mgbe BBC rutere na Nkwo Awgu, ebe mkpamkpa ahụ kpara, anyammiri na iru uju ka anyị hụrụ. Nwoke na-arụ taya ụgbọala (vulcaniser) ebe ahụ na nwa ọrụ ya soro nwụọebe ahụ n'ihi na low bed ahụ korola ha tụkpuo na mmiri. Ụgbọala 'low bed' ahụ kụbara ụgbọala bu ụmụakwụkwọ n'ime mmiri Nwunye nwoke ahụ na-arụ taya bụ Chukwuokoro Ifeoma, bere akwa ka ọ na-agwa BBC na ọ bụ naanị di ya na-eweta ego nri n'ụlọ, na ya enweghịzị onye enyemaka. Nwaokorobịa Chidubem Eze bụ onye nwanne ya na-agba ọgbatumtum, gwara BBC na ya eburula ozu nwanne ya tinye n'ebe nchekwa ozu. Mgbe BBC garuru na ya bụ ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka ahụ si, bụ nke ụka Katọliki nwe, onyeisi ha bụ Rev Sister Ebubechukwu Chifoma, ji anyammiri kwuo na obi agbawaala ya n'ihi na ya amaghị ebe ya ga-ebido ebido kasiwe ndị nne na nna ụmụ ha nwụrụ obi. Bishọpụ ụka Katọliki nke Awgu Diocese bụ Rt. Rev John Okoye, kwuru na e liela ụfọdụ ụmụaka ahụ ebe ha na-ekpe ekpere ka ndị nọ n'ụlọọgwụ gbakee. BBC hụrụ ndị mmadụ ebe ihe mberede okporoụzọ a mere Osote Gọvanọ Enugwu steeti bụ Cecilia Ezeilo bịakwara mgbaru n'ebe mkpamkpa ahụ kpara na Nkwo, ma gakwaara Bishọpụ Katọliki Awgu mgbaru. Osote onyeisioche Awgu bụ Ọkaiwu Lotachukwu Ogbonnia kwuru na ha na ndị obodo ejirila aka ha na-etinye mgbochi ga-eme ka ụgbọala jiri nwaayọ rifee ebe dị iche iche n'ụzọ ahụ, iji belata oke ọsọ ganye na gọọmenti arụzie ya bụ ụzọ. Ọtụtụ ndị hụrụ mgbe ọdachi ahụ mere kwuru na ọ dị ka ya bụ ụgbọala Low bed enweghị breeki, tinyere na ọ nọkwa n'oke ọsọ. Nnchọpụta anyị mere gosiri na ya bụ mgbada ugwu Nkwo Awgu na-enwekari ihe mberede nke ụgbọala kwa mgbe kwa mgbe, n'ihi na ọ bụ mkpọda ugwu." afirika-57111785,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57111785,Israel-Gaza violence: Lee isi okwu esemokwu a na ihe mere obibi ya ji ata akpụ,"Dịka ọkụ ọgụ na-ada n'etiti Izrel na Palestine na-enwuru ọkụ, otu United Nations adọọla aka na ntị na nnukwu agha nwereike ịda.","Ọgbaghara na-ada ugbua sonyere ịra anya e mere n'ọtụtụ ọnwa na Jerusalem, na-agbanyeghị na nsogbu adịrịla ruo ọtụtụ afọ. Kedụ etu o siri bido? Obodo Bethlehem n'ihe dị ka afọ 100 gara aga Nsogbu ruru afọ 100 Mba Briten weghaara mpaghara a kpọrọ Palestine na mpaghara Bekee na ""Middle East"" dịka e meriri Ala Eze Ottoman n'agha WW1. Ọ bụ ndị Arab kachasị n'ebe ahụ mana ndị Jew nọkwa ya. Nsogbu n'etiti ofufe abụọ a malitere ịrị elu n'oge mba ụwa nyere Briten ikike ikewapụtara ndị Jew obodo na Palestine. Ndị Jew na-ahụ ebe ahu dịka ala nna ha mana ndị Arab bi ebe ahụ sikwa na ọ bụ ala ha ma gbajọọ atụmatu mba ụwa wepụtara. Onye agha Haganah tupu a malite agha Mwereonwe Izrel n'afọ 1948 N'etiti afọ 1920 na 1950 ndị Jew na-abata ala ahụ riri elu ọfụma, dịka ha na-agba ọsọ mkpagbụ na Yurope nakwa ogbugbu egburu ha na agha mba ụwa nke abụọ. Ọgbaghara n'etiti ndị Jew na ndị Arab malitere ịkawanye njọ, dịka mgbajọ ọchịchị Briten malitekwara ịka njọ. N'afọ 1947, UN mere ntuliaka ka ekewaa Palestine abụọ, nye ndị Jew otu mpaghara, nye ndị Arab nke ọzọ ma mee Jerusalem obodo mba ụwa nwe. Ndị Jew nabatara atụmatụ a mana ndị Arab gbajọrọ ya, nke mere ka a ghara ime ya etu a. Ndị agha Arab na-agba ndị Jew egbe n'agha n'afọ 1948 Okike Izrel butere nnukwu agha Na 1948, dịka esemokwu a ekweghị mkpezite, Briten wepụrụ aka n'ọchịchị Izrel, ndị Jew wee kwuo na ọ bụ ha nwe mba Izrel. Ọtụtụ ndị Palistine ekweghị, nke a butere agha. Ndị agha si mba Arab ndị ọzọ buru agha bata. Puku kwuru puku ndị Palistine gbara ọsọ maọbụ a chụpụrụ ha na be n'atụmatụ ha kpọrọ ""Al Nakba"" bụ nke Bekee kpọrọ ""the ""Catastrophe"". Oge agha kwụsịrị n'afọ na-esote nke ahụ, Izrel ewerela ọka nkụ ala ahụ. Mba Jordan ji ala a kpọrọ West Bank ebe Ijipt ji nke a kpọrọ Gaza. Ekewara Jerusalem abụọ, ndị agha Izrel na Ọdịda Anyanwụ ebe ndị nke Jordan nọ na Ọwụwa Anyanwụ ya. Mapụ ugbua Na agha ọzọ a lụrụ na 1967, Izrel weere Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem, West Bank, Golan Heights nke Syria, Gaza nakwa Sinai nke Ijipt. Oge ndị Palistine ha na ụmụ ha gbara ọsọ chọrọ ịlọghachi na Gaza, West Bank, Jordan, Syria na Lebanon, Izrel ekweghị. Ndị ọchịagha Izrel na Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem ka ha napụrụ ndị Palestine ebe ahụ na 1967. Izrel ka nọ West Bank, na'agbanyeghi na ha pụọla na Gaza, mana UN ka na-ahụ ala ahụ dịka ala e ji eji. Izrel na-ewe Jerusalem niile dịka isi obodo ha, ebe ndị Palistine na-ewe Ọwụwa Anyanwụ obodo ahụ dịka isi obodo mba ha ma mecha nwete ya. Mba Amerịka sọ na ụfọdụ mba kwenyere na Izrel nwe obodo ahụ niile. N'ime afọ 50 gara aga, Izrel arụọla ụlọ na mpaghara ndị a. Ihe karịrị ndị jew 600,000 bi ebe ahụ. Ndị Palistine na-akọwa na iwu ụwa anabataghị obodo a ndị Izrel hibere mana Izrel sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ihe na-eme ugbua? Nsogbu na-adịkarị n'etiti ndị Izrel na ndị Palistine bi na Jerusalem, Gaza, na West Bank. Ọ bụ otu Hamas na-achị Gaza. Hamas na-aluso Izrel agha kwamgbe. Izrel na Ijipt pịchịrị okeala ha na Gaza iji gbochie ngwa agha iru Hamas aka. Ndị Palistine bi na Gaza na West Bank sị na ha na ata ahụhụ maka mmachị Izrel. Izrel sị na ha na-eme nke a iji gbochie mwakpo ndị Palistine. Nsogbu arịwala onwe ha elu kemgbe ndị alakụba malitere emume Ramadan nke 2021. Ndị uweojii na ndị Palistine na-alụ ọgụ kwa abalị. Egwu a na-eyi na a ga-achụpụ ndị Palistine bi na Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem sokwa ebute iwe. Anwụrụ anya mmiri a gbara ndị na-eme ngagharị iwe dịka ndị nchekwa Izrel na ndị Palistine na-alụ ọgụ n'oke ala Izrel na Gaza. Gịnị bụ isi okwu ndị a kpụ n'ọnụ? E nwere nsogbu ole ma ole ndị Izrel na Palistine anaghi enwe kwekọrịta na ha. Nke a gunyere ihe ga-eme ndị Palistine gbara ọsọ ndụ, ma ndị Jew bi na West Bank a ga-anọdụ maọbụ pụọ, ma agbụrụ abụọ a ga-eke Jerusalem, nakwa - nke kachasị taa akpụ - ma a ga-enwe mba Palistine dịka e nwere nke Izrel. Okwu udo na-aga n'ihu kemgbe afọ 25, mana enwetabeghị mkpebi ọbụla okwu a. Kedu ihe dị n'ihu? Ọtụtụ na-ekwu na okwu a agaghị ebi na nsonso a. Onyeisiala Amerịka pụrụ apụ bụ Donald Trump hazikwara ikpe udo n'etiti Israel na Palestine, nke ọ kpọrọ ""deal of the century"" na bekee. Mana ya bụ ikpe udo amịtaghị mkpụrụ n'ihi na Palestine kwuru na ọ bụ naanị ndị Izrel ka ọ kwadoro. Udo ọbụla a ga-ekpe n'ihu ga-emetụtarịrị nsogbu ndị a nile. Ruo oge nke ahụ ga-eme, ọgbaghara ga na-aga n'ihu. Follow Newsbeat on Instagram, Facebook, Twitter and YouTube. Listen to Newsbeat live at 12:45 and 17:45 weekdays - or listen back here." afirika-45640327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45640327,Anaghị ere nwaanyị ere,"Ọbụghị ihe na-agbagwoju anya na ihe ọbụla Chimamanda Ngozi Adichie kwuru bụ ihe ndị mmadụ, n'ụwa niile, na-enyocha enyocha.","Nke a mere ka ihe o kwuru okwu banyere ịkwụ ụgwọ n'isi nwaanyị - bụ omenala ndị Igbo ka na-eme ugbua - soshal midia Naịjirịa nwụrụ ọkụ. BBC Igbo gbara mbọ ka anyi nụta n'ọnụ onye ji ya bụ okwu na mkparịta ụka ya na ndị ntaakụkọ mere banyere atụmatụ o wepụtara eji akụziri ndị odee akwụkwọ akpọrọ ""Farafina Creative Writing Workshop"" na Bekee nke emere na Ikoyi ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba bụ Monday. Chimamanda gwara BBC na ọ bụ nghọtaghị ka ndị mmadụ mere okwu o kwuru, wee gaa n'ihu kọwa na ihe ya na-ekwu bụ na-ekwesiri itinye anya n'ihe banyere ịkwụ ụgwọ isi nwaanyị makana ụfọdụ na-emezi ya ka a na-ere, maọbụ ịzụta, nwaanyị ka ọ bụ. Gee ya ntị n'elu. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56327058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56327058,Covid-19 Vaccines FAQ: Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19,N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachi ka ọgwụ mgbochi si n'otu COVAX nakwa ụlọọrụ Astrazeneca tụrụ ụkwụ na Naịjirịa.,"Ajụjụ niile i nwere maka ọgwụ mgbochi Covid - 19 Dịka ụbọchị ole na ole gara, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa osote ya bụ Yemi Osinbajo gbara ọgwụ ahụ n'ihu ala niile iji gosi na-onweghi ihe ọjọọ dị na ya. N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ ka chị obi ha n'aka maka ọgwụ a ma na-atụ ụjọ maka ihe o nwereike ịme. Anyị edetuola ụfọdụ ajụjụ a ma za kwa ya iji kasie ndị mmadụ obi. Kedụ ebe m nwereike ịgba ọgwụ a? Ụlọọrụ a kpọrọ National Primary Health Care Development Agency ewepụtala usoro ị ga-eji denye aha gị n'igwe kọmpụta. Ị nwekwara ịke ịhọrọ ebe ị chọrọ ị gba ya bụ ọgwụ nakwa ebe dị nso na be gị. Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde abụọ edenyela aha ha ịgba ọgwụ a. Ka e si ewepụta ọgwụ mgbochi covid - 19 n'Afrịka Ego ole ka ọ ga-ewe m? Gọọmentị etiti akpọpụtabeghi ego ole ọ ga-ewe mmadụ iji nata ọgwụ mgbochi a. Kama ha kwuru ka ndị ọrụ ahụike nakwa ndị okenye na ndị ọrịa na-arịa gbaa mbọ hụ na ha wetara onwe ha ebe a na-agba ọgwụ a. Kedụ ihe ọ na-eme n'ahụ mmadụ? Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garbe Shehu kwuru na o nweghi ihe ọbụla merela onyeisiala mgbe ọ gbachara nke ya. Mana gọọmentị mba Briten kọwara na o nwere ụfọdụ ngosi mmadụ nwereike ị nwe ga-ejikwa aka ya kwụsị n'ime otu izu Ha gụnyere: ike ọgwụgwụ,isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, ịkọ ọkọ n'ebe agbara gị ọgwụ, ọkpụkpụ ịgbu mgbu, ahụ ọkụ ndz. Enwerem ike ibute ọrịa covid-19 ọzọ ma m gbachaa ọgwụ a? O dobeghi anya ma nke a enwereike ịme n'ezie mana ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO kwuru ka ndị mmadụ jide ka ha ji. Nke a pụtara ""kpuchie imi gị, kwọọ aka gị, dopu onwe gị iche ganye mgbe mpụtara ga-egosi na ọgwụ mgbochi achụlaala covid-19 kpam kpam. Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ịma - Anaghị agba ụmụaka ọgwụ a - Ọgwụ mgbochi a enweghi nje coronavirus n'ime ya dịka akụkọ ụgha si kwuo. - Amabeghị ma ọ na-ekpuchi ndị mmadụ n'ebe ụdịrị ọhụrụ ọrịa a dị (dịka mba UK na mba Saụt Afrịka)" afirika-44284068,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44284068,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị ọchi ehi awakpola ụlọakwụkwọ na Jalingo,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ndị ọchị ehi awakpola ụlọakwụkwọ ndị Katọlik,"Ndi o ji egbe a na-eche ka ọ bụ ndị ọchi ehi wakporo ụlọakwụkwọ Secret Heart Minor Seminary dị na Jalingo nke Taraba Steeti n'isi ụtụtụ taa. Ha gbajiri otu onye ụkọ chukwu akpọrọ Cornelius Koba ụkwụ ma mebie nwga ụlọ ruru ọtụtụ nde naịra. Mụ na Rochas anaghị ese okwu Osote gọvanọ Imo Steeti bụ Prince Eze Madumere agọrọla ụkwụ na aka ya na-akụkọ kwuru na ndị mmadụ chọrọ ka ya na Gọvanọ Rochas mee udo Madumere kwuru na ya na Rochas anaghị ese okwu kama na ha nwere nghọtaghe n'echiche na usoro. Akụkọ mba ofesi; Mba Fransị echiela Nwafọ mba Mali dike Otu nwaokorọbịa bụ Mamoudu Gassama nwafọ mba Mali abụrụla onye eturu dike na mba Fransị mgbe ọ zọpụtara otu nwatakịrị chọrọ isi n'elu ụlọelu daa Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwere nkwa inye ya akwụkwọ ịbụ nwafọ mba Fransị. N'egwuregwu; Otu onye nkwado Mohamed Salah ederela FIFA na UEFA akwụkwọ ka ha taa Sergio Ramos ahụhụ kwuo na aka ya dị mmerụ ahụ Salah nwere, ọtụtụ puku ndị ọzọ etinyela aka n'akwụkwọ ahụ. Salah n'onwe ya ekwuola na ọ ga-eso ndị Egypt agba asọmpi iko mba ụwa. Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee etu ndị APC ji kataka were gbasaa ntuli aka ha n’Enugwu" afirika-50386375,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50386375,Enyimba Economic City: Gịnị ka ọ bụ?,"Dịka Onyebuchi Ememanka si gwa BBC Igbo, ọ bụ atụmatụ ndị ụlọọrụ abụghị nke gọọmentị gbakọtara chọọ ịrụpụta, nke ga-eme ka e nwee ebe dị ka obodo Dubai na steeti ahụ.","Okezie Ikpeazu banyere ọchịchị agba nke mbụ dịka Gọvanọ Abia n'afọ 2015 Ememanka bụ ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti, kwuru na ọ bụrụ na a rụọ ya, na o nwere ikike inye ihe karịrị ihe karịrị mmadụ 700,000 ọrụ n'ime ihe ruru afọ iri. O kwuru na gọọmentị etiti nwere pasentị iri abụọ n'ime EEC a, ebe gọọmentị Abịa nwekara nke ha. O kwukwara na gọọmentị etiti enyela Abịa steeti ihe ọ kpọrọ 'export processing zone license' nakwa 'license for inland port'. O kwuru na ego gọọmentị agaghị aba n'ime ya, mana Gọvanọ Ikpeazụ na-akwadosi ya ike. Ikpeazu ọgaala ịchọta ego o ji arụ 'Enyimba Economic City'? Aka na-achị Abịa steeti bụ Ikpeazu agaala mba Saụt Afrịka ịga chọta ego o kwuru na ọ chọrọ iji rụọ ihe ọ kpọrọ 'Enyimba Economic City'. Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Ememanka gwara BBC Igbo nke a ka anyị na ya kpara n'ekwentị. Ememanka bukwa ụzọ tinye ya n'elu Facebook ya. Ndị ụlọomeiwu bịara Aba ịchọpụta ihe mere na Ndịegoro Kọmitii ndị na-ahụ maka ndị uweojii, ọgwụike na ikike dịrị onye n'ụlọomeiwu nta gara Aba, Abia Steeti ịchọpụta nke bụ eziokwu n'ihe mere n'etiti ndị uweojii na ndị bi na Ndịegoro. Cheta na ọgbaghaara dapụtara n'etiti ndị mmadụ na ndị uweojii nke mere e ji gbaa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ. 'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ' Ndị ụlọomeiwu a zutere ndị ihe metụtara, kọmishọna uweojii n'Abia bụ Ene Okon, ndị ọkaiwu nakwa ezinụlọ Adibenma John Chinonyerem nwoke nwụrụ n'obi nkolopụ n'ihi ụda egbe. Onyeisi kọmitii a bụ Ayeni Babatunde sị na ha abịaghị Aba ịkatọ maọbụ ikpe onye ọbụla ikpe kama ọ bụ isi imi n'ala chọpụta ""etu mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ"". O kwere nkwa na ha ga-achọpụ nke bụ eziokwu ma kpee ikpe ziri ezi. Onye du ha bịa njem a bụ onye na-anọchite anya Aba South n'ụlọomeiwu nta bụ Ossy Prestige bụ onye mere ka ụlọomeiwu mata maka ọgbaghaara ahụ. Aba Police: Lee ụlọ ndị mmadụ sị na ndị uweojii gbara ọkụ n'Aba Ndị ụlọomeiwu ọzọ so bịa njem a gụnyere Nkem Abonta, Ikengboju Gboluga Dele na Tijani Kayode na ndị ọzọ. Ndị DSS chụsara ndị na-eme ngagharịiwe Iwe ji nwoke na-abara onye uweojii mba n'ọgbọ egwuregwu Naịjirịa dị na Legọs Ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ 'DSS' gbakanyere egbe na anwụrụ anyammiri were chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe ka a tọhapụ Omoyele Sowore n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ndị DSS jichiri Sowore n' agbanyeghi n'ụlọikpe enyere iwu ka a tọhapụ ya ka ọ nọchara ọnwa atọ na mkpọrọ. E merụrụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ gụnyere nke ụlọakụkọ Guardian ahụ na ọgbaghara ahụ. Ụlọomeiwu chọrọ ime iwu megide okwu ịkpọ asị Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a Ndị ụlọomeiwu ukwu ewepụtala atụmatụ iwu ga-ehiwe ngalaba ga na-enyocha okwu asị na Naịjirịa. Iwu a bụ nke onye bụbu ọnụ na-ekwuru ha bụ Sabi Abdullahi kwadoro a gafeela ngụpụta nke mbụ ya n'ụlọomeiwu. N'ofesi Ụgbọelu agha ndị Izrel agbagbuola otu onye ndu ndị na-eyi ndu egwu bụ Baha Abu al-Ata na nwunye na Palestine. Ndị otu a sị na Abu ai-Ata nwụrụ mgbe ogbunigwe gbara n'ụlọ ya, ebe ụmụ ya anọ na onye agbataobi ha merụrụ ahụ. Praịm mịnịster mba Izrel bụ Benjamin Netanyanhu sị na Abu al-Ata bụ ogbunigwe na-echere oge ọ ga-agba na mba Izrel. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Terry G ọ ka Naira Marley agụ egwu? Okwu na-ewu na soshal midia ugbua bụ etu otiegwu a ma dịka Terry G si bụrụ ekwuchaa ọgwụ ma a bịa n'egwu n'afọ ole na ole gara aga. Nke a malitere dịka ndị mmadụ ji ya atụnyere ndị nke na-agụ egwu ugbua dịka Naịra Marley. N'egwuregwu, Kedụ ndị ga-eji ibe ya gwọrọ abacha mgbe Zambia na Naịjirịa ga-esukọta isi n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ? Cheta na Aịvọrị Kost ji otu ọkpụ a na-asaghị asa merie ndị Dream Team Naịjiria abalị atọ gara aga. Igbo nwere mmadụ, Nwaafọ Naịjirịa bụ Chike Ofili eritele ntụrụgo akpọrọ 'TruLittle Hero awards' n'ihi nchọpụta o mere maka mgbakọ na mwepụ na mba Briten. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Iwe ji ndị mmadụ makana Aisha Buhari sị ka ekpewere Naịjirịa ekpere ""Ọ bụ ekpere ga-azọ Naịjirịa?"" Ajụjụ a ka ndị mmadụ na-ajụ banyere oku nwunye onyeisiala Naịjirịa kpọrọ. Iwe ji ụfọdụ ndị Naịjirịa n'elu soshal midia maka oku Aisha Buhari kpọkuru ndị ụka alakụba nọ n'ọkwa gọọmentị ka ha kpewere Naịjiria ekpere. Ha kwuru na iwe ha bụ etu e si asị kpewere Naịjirịa ekpere oge ọbụla kama ịrụ ọrụ ndị mmadụ na-atụ anya na ha kwesịrị ịrụ. Lee ụfọdụ iwe ha: 'Kwụọnụ ụtụisi unu' Ngalaba na-ahụ maka nhibe ụlọọrụ a kpọrọ Corporate Affairs Commission akpọkuola ndị hibere ụlọọrụ na Naịjirịa ka ha gbaa mbọ na-akwụ ụtụisi ha ma ọ bụrụ na ha achọghị ka a kachapụ aha ha n'akwụkwọ ndị hibere ụlọọrụ. CAC kwuru na ọ dị mkpa na ndị mmadụ kwụrụ ụgwọ a, makana ọ ga-eme ka ha mara ụlọọrụ ndị ka kwụ chịm ma ndị nke na-akwụghị. Ọkụ na-agba ebe ruru 50 na mba Ọstrelia Ndị bi na mpaghara New South Wales na-anwa ịmenyụ ọkụ I nwere ezinaụlọ maọbụ ndị enyi na mba Ọstrelia? Biko dọọ ha aka na ntị ka ha kee nkwụcha maka ọkụ jaa jaa na-abịa. Nke a si na mkpu ndị mba ahụ na-eti maka ọkụ na-agba ọzara maliterela n'ihe karịrị ebe iri ise na steeti New South Wales, nke a sị ka ga-enwuru zaa na-aga. Ọ kwaala Sterling Gareth Southgate bụ onye nkuzi otu egwuregwu mba Ịngland ekwuola, na Raheem Sterling agaghị eso ha gbaa asọmpi ha na mba Montenegro n'ụbọchị Tọọzde na-abịa. O kwuru nke a maka mba Sterling na Joe Gomez bara mgbe Liverpool kwọriri Man City ụbọchị ụka gara aga. Ihe nkiri a ga-amasị gị Ndị Ghana agbachiela ụlọ ahịa ndị Naịjirịa ọzọ" afirika-52270414,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52270414,Eid-el-Kabir: Ihe ndị ị ga-ejinwu ụbọchị ezumiike abụọ a mee,"Gọọmentị Naịjiria ekwuola ka ndị mmadụ were ụbọchị abụọ zuru ike maka emume Eid-el-Kabir, mana gịnị ka ị ga-ejinwu ha mee?","Nye ụfọdụ ndị, ụbọchị abụọ ahụ dịkwa ka ụbọchị ọbụla ha na-agaghị ọrụ, mana nye ụfọdụ ndị ọzọ, ọ bụ mgbe ha ga-emeju ihe Bekee kpọrọ Activity afọ. Mana ị ma na ị ga-emenwu ka ụbọchị abụọ ahụ baara gị uru site n'ime ihe ndị a anyị ga-atụlitere gị elu ugbua: 1) Rahụ ụra N'ezie i nwereike ịjụ ma ""isi ọ dịkwa onye dere akụkọ a mma"", mana eziokwu bụkwanụ na ezigbo ụra bụ ndụ. Ọtụtụ ndị anaghị enwetekarị ohere ịrahụ ezigbo ụra n'ihi ihe gụnyere: Mana ihe ọma ị nwereike imere onwe gị n'ime ụbọchị abụọ a gọọmentị ji menyere gị, bụ ịhụ na gị na ụra bụ nwanne mgbe ọbụla ọ tụwara gị, n'ihi na ọ ga-eso n'ihe ndị ị ga-achọ achọ ma sị ""a matara m mee"" mgbe ị ga-alaghachịkwa ọrụ. Ọ ga-edozikwanụ gị ahụ ọfụma. 2) Gụọ akwụkwọ Onye na-agụ akwụkwọ na-emepe ụbụrụ nakwa anya ya ma na-akụziri onwe ya ọtụtụ ihe dị iche iche ga-abara ya uru n'ụwa. Ịgụ akwụkwọ na-eme ka mgbakasị ahụ nke Bekee na-akpọ ""stress"" belata nke bụ na ị na-enyekwa onwe gị ezumike ruru gị mgbe ị na-agụ ya. Ọzọ bụ na onye na-agụ akwụkwọ na-atọ ya ụtọ maọbụ na-akụziri ya ihe anaghị ederu ya ala, nke a ga-enyere gị aka ịkpị ""data"" dị n'ekwentị gị ị gaara eji agazu ụwa dum na soshal midia. 3) Rie nri Nwanne nri dị ezigbo mkpa, mana dịka ọnọdụ dị ugbua, ọ dị mkpa iri naanị mgbe ọ gụrụ gị kama ị na-atagharị ọnụ chọm chọm chọm (ọkwa ị chịala ọchị ugbua makana e jidere m gị). Gbaa mbọ hụkwa na nri ị na-eri bụ nke na-edozi ahụ dịka akwụkwọ nri na mkpụrụosisi. Gọọmentị enyela gị ikike ịnọ n'ụlọ hapụ ịrụ ọrụ ụbọchị ahụ, ihe ọma ị ga-emere onwe gị bụ iri ihe ọbụla gụrụ gị, etu ọbụla o si gụọ gị. 4) Tụọ ute n'ala soshal midia/zụchaa ego gi Ekwenyere m na m sị gị gụọ akwụkwọ kama ịga soshal midia, mana ọ bụ naanị ụbọchị abụọ a ka i nwere ime ihe ọbụla gbasara gị tupu ọrụ ebidokwa n'ike ọzọ. Akụkọ asịrị ahụ na-efegharị ị kwere onwe gị nkwa na ị ga-ewetu obi mara ihe butere ya na ihe mechara mee, gaa chọta ya gụzuo ya. Ọrụ ahụ ị chọrọ itinye akwụkwọ maka ya, nwaanyị maọbụ nwoke ahụ ị chọrọ ịchụta, ugbua bụ ohere gị. Ego ahụ ị na-akpị kemgbe, were ya zụrụ uwe ọma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe ntecha, na ihe ndị ọzọ na-aba gị n'anya mgbe ị ji ọrụ n'aka. Ugbua, enweghizi onye ga-asị gị ""ngwa wetuo ekwentị gị, apịzịla ya ka ị ghara ịpịwa ya"" maọbụ ""ọkwa ị hapụla ọrụ ị na-arụ pịwa ekwentị"". 5)Gwuo egwuregwu Ọ bụ gị na ụmụaka bi n'ime ụlọ maọbụ n'agbataobi? I nwere ohere imenye ha obi aṅụrị. Bụrụ nne, nna, deede maọbụ daada nke a ga-eji ime obi aṅụrị mara site na iji egwuregwu debanye aha gị n'obi ụmụaka ndị a. Kuziere ha etu e si esi nri, eghe ihe n'ekwu ọkụ, etu e si ese ihe, etu e si agba egwu, kọọrọ ha akụkọ ifo, gụọrọ ha egwu ọnwa dgz. Ị nwekwara ike ịkpọkọta ha ọnụ gụọrọ ha akwụkwọ na-atụ ụtọ, na-agbanwe olu gị ka ị na-agụ ya. Ha agaghị echefu nke a echefu. 6) Lee ma ị ga-amụtanwu otu akaọrụ Nke a abụghị iwu o, mana ọ ga-abụ ihe dị mma nyere gị ma ọ bụrụ na ị ji ohere ndị ị nwere wee mụta otu ihe maọbụ abụọ ị na-amabughi eme mbụ. Nwanne m nwoke/nwaanyị, ọ bụrụ nri ka ị maghị esi, I nwaa ya ugboro abụọ atọ maọbụ anọ n'oge a I nwere ohere, I ga-amụta ya o bụrụgodi obere (nwanne agbakwala ụlọ ọkụ oo). Ọ bụrụ ịdụchi akwa dọkara adọka were nkịkara akwa mụwa ya ị ga-amụta ya. Ị maghị akpa isi mana e nwere ndị bu ntutu ebe ị nọ? Rịọ ha ka ị jiri ohere a mụta etu e si eme ya." afirika-43634771,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43634771,Mụta etu ị ga esi sie ofe ọha ga-eme ka ị rachaa aka gị,"Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọ bụrụ na Ị bụ onye Igbo ma Ị ribeghị ofe ọha, ị maghị ihe na-atụ ndụ mmanụ.","Ofe ọha so na nri ndị Igbo na-ejighị egwu egwu Maka na Igbo nwere olumba dị icheiche, ụfọdụ na-akpọ ya 'ọha' ebe ndị ọzọ na-akpọ ya 'ọra'. Ọha bụ akwụkwọ osisi ọha. A na-egbuji maọbụ bejiri ya karịa ịkpata ya n'ọhịa. Ọha na-enwe 'oge', ọ na-apụtakarị n'oge ọkọchị. Mgbe ahụ ka ị ga-enweta nke ahụ dị mma ọfụma. Ị na-eri ofe ọha tọrọ ụtọ mana ị maghị etu esi esi ya? Nke abụ ohere gị iji amụta ya. Ngwanri e ji esi ya Ọha anaghị amị oge ọbụla, ya mere o ji amasị ndị mmadụ iri ya oge ọ ka dị mma ọfụma Kwado ihe ndị ị ga-eji esi ya: Enwere ede ụrị nakwa ede ofe Etu esi esi ya Ọ na-adị mkpa ịkwụ aka gị tupu ị metụ ihe nri ọbụla aka, ya mere anyị ga-eji asị gị kwụọ aka gị ọfụma. Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu isie ọha gị: Ụfọdụ na-eji mkpụrụ akwụ esi ofe ọha kama iji mmanụ nri azụtara n'ahịa Ihe ndị e ji eri ofe ọha Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọ bụ akpụ a sụrụ asụ kacha mma iji elofe ofe niile. Kama e nwere ihe ndị ọzọ eji elofe nri dịka: Ị mụtala etu I ga-esi esi ofe ọha gị ugbua?" afirika-51785631,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51785631,Coronavirus: Ihe o ji raa ahụ ịkwụsị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ya,Otu n'ime ihe dị iche anyị na ụmụanụ bụ na mmadụ na-emetukarị aka n'ihu na-amaghị ama.,"Anyị na-emetu aka n'ihu anyị ma ghara ịma na anyị na-eme ya Ọ bụ agwa a na-enyekarị ọrịa Covid 19 aka agbasa. Maka gịnị ka anyị ji emekarị ya ma kedụ otu anyị ga-esị kwụsị ya? Ụmụnje na-esikarị n'ọnụ, ime nakwa n'anya aba mmadụ ahụ Gịnị ka anyị ji eme ya? Ọ dịka ọ bụ ebum pụtaụwa na mmadụ na ụfọdụ anụmanụ dịka adaka na-emetụkarị aka n'ihu ha. Ọkammụta na Saịkọlọji bụ Dacher Keltner nke mahadum UC Berkeley for America sị na imetu aka n'ihu na-eme ka mmadụ nwete onwe ya ma mgbe ụfọdụ anyị na-eme ya ma anyị hụ onye anyị huru na anya. Ndị ọkammụta ọzọ gbasara agwa mmadụ sị na anyị na-eme ya mgbe ụfọdụ ka anyị were chịkọnata obi anyị maọbụ dowe obi anyị otu ebe. Mana nsogbu bụ na ọ bụ ya bụ agwa na-ebusa nje n'ahụ mmadụ. Iji maa atụ, ọrịa Covid 19 na-esi na mmiri ahụ mmadụ dịka asọmmiri abanye ndị ọzọ n'imi maọbụ n'ọnụ. Ọ bụghịkwa naanị mmadụ na-emetu aka n'ime Mmadụ nwere ike ibute nje site n'imetu ihe ya bụ nje dị aka bụ ebe ọ nwere ike ịnọ rụọ abalị itoolu. Ọ bụ ogologo ndụ a ya bụ nje na adị, ya na ka o sị esi n'aka mmadụ meturu n'ihu banye na ahụ mmadụ mere ya bụ nje ji dị ajọ njọ. Ọkammụta ndị Mahadum Leeds bụ Stephen Griffin na-akọwa na iji akwanza bekee kpọrọ ""face mask"" kpuchie ihu nwere ike ime ka mmadụ metudebe aka n'ihu karịa ịza ikuku nke ha che na o bu nje ọrịa ahụ. Kedụ ihe anyi nwere ike ime iji kwusilata imetu aka n'ihu? Ọkammụta n'ihe gbara agwa ndi mmadụ na Mahadum Columbia bụ Michael Hallsworth sị na ịkwusị ndị mmadụ imetu aka n'ihu ha hiara ahụ. Ọ sị na ọ ka mfe ịsị ndị mmadụ kwọwa aka karịa ịsị ha emetuzila aka n'ihu. Kedụ ka ị ga-esi kwusili ihe ị maghị na ị na-eme? Ọkammụta a sị ka anyị chọwa ihe mere mmadụ jikarị emetu aka n'ihu iji mata ka anyị ga-esi kwọọ ya bụ ọrịa. ""Ọ mara atụ sị na onye ọkọ na-akọ n'ihu nwere ike iji azụ aka kọo ya karịa iji mbọ"". Ọ sịkwa na ""ọ bụghị na nke ahụ dị mma kama na ọ ka mma"". Ọ sịkwa ""ndị na-akọkarị ọkọ n'anya nwere ike iyi ugegbe anya, maọbụ tukwuruala n'elụ aka ha ị iji gbalahụ ọnwụnwa ya"". Ịkwọcha aka nke ọma bụ ebe anọ Ị nwere ike iji ihe ndị ọzọ ị ga-eji emegharị aka dịka nke akpọrọ ""stress ball"" na Bekee bụ nke ị ga-eji ọgwụ eji egbu nje hichaa nke ọma. Mana a eyikwala afe aka Bekee kpọrọ ""glove"" maka ọ bụrụ na ị naghị agbawe ya ka o kwesiri ma yiri ya na-akwọ aka gị, nje nwere ike ị banye na ya. Ụzọ kacha mma iji gbochie ya bụ ọrịa bụ ịkwọcha aka nke ọma. Dịka onyeisi na WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus kwuru ""e chela ka e wepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a, ị mara ihe ị ga-eme iji nyere onwe gị na ndị ọzọ ka taa, bido ozugbo"". Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-43261321,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43261321,Na Kenya a wala otu onye ekwesighị isi,"Ọ na-akpọtụ akpọtụ na mba Kenya n'otu nnukwu ụlọgwụ, Kenyatta National Hospital ebe ndị dọkịta na-awa ahụ wara otu onye ekwesighị ahụ.","A wara nwoke na-ekwesịghị isi Dịka akụkọ onye ntaakụkọ BBC nọ na Nairobi bụ Anne Soy, siri kwuo, a kwusịla dọkịta na ndị nọọsụ mere nke a ọrụ n'ike. Nke a bụ nnukwu nghakọ ndị na-arịa ọrịa enwerela n'obodo ahụ. A kwabatara mmadụ abụọ na-arịa ọrịa na amaghị onwe ha n'ụlọọgwụ ụbọchị ụka; otu nwere mkpụkọ ọbara n' ụbụrụ, nke ọzọ nwere ebe zara aza n'isi ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: E kweresịrị iwepụ mkpụkọ ọbara ngwangwa kama a wara isi onye nke nwere ebe zara aza n'isi ya. Ọ bụ mgbe dọkịta wara isi ahụ ka ọ ghọtara nzọghe ahụ ha mere. Onyeisi ụlọọgwụ ahụ kwuru na ọnye ahụ awara isi na-adị mma ma kwukwa na nyocha na-aga n'ihu. Mana ndị dọkịta nọ n'ụlọọgwụ kwụnyere onye otu ha n'azụ. ha na-asị ndị isi ụlọọgwụ nye onye ọ dịri ịkwadọ ma nye ndị ọria akara jị mata onye bụ onye. Ngalaba nyocha ọrụ ahụike dị n'aka kwuru na nke a bụ mbụ a na-enwe ụdị nghakọ na mba Kenya. Ha enyela ụlọọgwụ ahụ iwu ka ha nye akwụkwọ nkọwa ihe mere, ebe kwuru na ha ga-eme gbatakwuoọnụgi banyere ya." afirika-46504345,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46504345,Jubril of Sudan: 'M ga-aṅụ iyi na ọ bụ Buhari nọ n'Aso rock',"Ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị ọnụ na-eru n'okwu, asaala Nnamdi Kanu maka ihe isii o kwuru gosiri na ọ bụghị Buhari nọ n'ụlọ onyeisiala.","Buhari apụtala kwuo n'izuụka gara aga na ya abụghị Jubril nke Sudan Minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ bụ Chris Ngige, ṅụrụ iyi na ọ bụ Muhammadu Buhari nọ n'oche onyeisiala. O kwuru na ọ bụ dibia Bekee nyere onyeisiala Buhari ọgwụgwọ puruiche ahụ ya nabatara ọfụma. Ngige kwuru nke a mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ n'okpuru ọchịchị Idemmili dị n'Anambara steeti. Ndi ntorobia otu Ugwu a kpọrọ ""Arewa Youth Consultative Forum (AYCF)"" kwuru na Kanu bụ onye na-aṅụ ọgwụ ike ndị mmadụ ekwesịghị ige ntị.‏ Ihe ndị ọzọ na-ekwu na soshal @JohnPau2395667 kwuru na kama ịkatọ Kanu, na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ mee nyocha gbasara ihe ndị o kwuru. @UcheOssai10 kwuru na ọ dị mma ka onyeisiala gosikwa Kanu n'ụzọ sayensi, na ọ bụ Buhari n'ezie na ọ bụghị Jubril nke Sudan. @topluv1234 kwuru na Kanu amaghị ihe ọ na-eme makana ọ ga-atụnyere Buhari ọzọ. @solanougwu33 kwuru na ebe ọ bụ na Ngige na-ekwu na ọ bụ Dọkinta mere ka Buhari gbanwe n'anụ ahụ, na ya na-ele anya ka ọ hụ ka Ngige ga-esi mee nke ya ma ọ gbagote n'afọ. Ihe isii Nnamdi Kanu kwuru iji gosi na Buhari bụ Jubril nke Sudan Cheta na Buhari gwara ụmụ Naịjirịa nọ na Poland mgbe ọ gara ọgbakọ, na ọ bụghị onye a rụrụ arụ ""clone"", kama na ọ bụ Buhari n'ezie. Etu ọ dị ugbua, ụlọọrụ onyeisiala ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu ọhụrụ Kanu kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50045982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045982,Rivers Flooding: 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị',Ndị mmadụ bi n'ụfọdụ ebe na Rivas steeti etiela mkpụ rịo ka gọọmentị were ọsọ were ije bịa nyere ha aka dịka idemmiri na-enye ha ọsọ n'obodo ha.,"Ọtụtu ndị bi na Rumuokwurushi akwapụla maka mkpamkpa idemmiri na-akpa ebe ahụ. Ka ọ dị ụgbua, ha na-eji ụgbọmmiri abata ma na-apụ n'ụlọ ha. 'Ajọ nsị na ọrịa na-echere anyị aka mgba.' - Favour Ikechukwu Otu nwaanyị bụ Beatrice Offem, onye ụlọ ya dị n'ogige obibi 'Valley of Decision' gwara onye ntaakụko BBC na kamgbe ọnwa Sepụtemba, na ha na-eji ụgbọmmiri eme njem. Offem kwuru si ""Anyị na-egbu agwọ na anụ ndị ọzọ idemmiri na-ebubata n'ime ụlọ anyị"". ' Kamgbe 2016 ka idemmiri mewere anyị ịwa' - Innocent Dominic O kwukara sị ""Mmiri a na-erute anyị n'obi, ihe anyị chọrọ bụ ezigbo ọwammiri maka na anyị enweghi ọwammiri ebe a"". O kwukwara na ha na-akwụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri a otu narị naịra iji bufee ha. Ndị ji ụgbọmmiri na Rmumuokwurushi. N'aka nke ọzọ ka ndị bi n'Ahọada, Abua na Ogba Egbema, Ndoni na-ekwu na idemmiri awakpoola ha kamgbe 2017. Joy Brown abọọla ihe ọ kụrụ tupu ha eruo oge ha. Baseme Akio kwuru na idemmiri a na-ebutere ha ọrịa dị iche iche dịka ịba na azụ mgbu. Lee ihe idemmiri na-eme n'ala Igbo ugbua O kwukwara sị na ha ahụbeghị enyemaka gọọmentị. Ndị bi n'Ahọada na-ekwu na id mmiri na-ebutere ha ọrịa dị iche iche. Ihe ndị otu gbatagbata NEMA nwere ikwu Onyeisi ndị otu ọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Authority (NEMA) nke mpaghara Ndịda-Ndịda bụ Ibarakumo Walson, gwara BBC na ha achọpụtala na ọ bụ mmiri ịsọfe oke, enweghị owammiri na oke idemmiri (flash Floods) kacha ebute nsogbu. ""N'oge na-adịghị anya, mmiri nwere ike ilo obodo ndị a"" - Ibarakumo Walson Walson kwuru na ọ bụru na egwughị ala mmiri, ma rụọkwa ọwammiri, na ndị obodo a ga na-ata ahụhụ afọ niile. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ" afirika-45545496,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45545496,Aga m etinye ndụ m maka Nwosu ịbụ gọvanọ - Okorocha,Akụkọ kachasị mkpa taa: Gọvanọ Okorocha a ṅụọla iyi,"Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha e forola ntụtụ taa na ọ ga-ekwerịrị ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu n'aka dịka gọvanọ ga-anọchi anya ya. OKorocha n'oge o duru Odeakwụkwọ gọọmenti Imo State bụ Mark Uchendu na dị ọzọ n'iyi ọrụ kwuru na ọ ga-etinye ndụ ya na ọbara ya iji hụ na o nyere Nwosu ọkwa ọchịchị. Ụlọomeiwu etinyela anya n'akwụkwọ ntuliaka Ụlọomeiwu amalitela ọzọ taa ileba anya n'akwụkwọ nhazigharị ntuliaka bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ibinye aka. Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka bụ Suleiman Nazif kwuru na nke a bụ maka ọ dị mma ndị Naịjirịa. Akụkọ si mba ọzọ Ụlọikpe mbaụwa na-ahụ maka mpụ a maala onye bụbu osote onyeisiala mba DR Congo bụ Jean-Pierre Bemba ikpe ma tụọ ya mkpọrọ otu afọ. Ụlọikpe a kwuru na o nyere ndị akaebe ngarị n'ikpe a na-ekpe maka mpụ ọ mere n'agha megide mmadụ. N'egwuregwu Otu jikọtara ndị ogbu bọọlụ na mba Ghana a machibidola ndị otu ha mmadụ isii ọzọ igbu bọọlụ ka e mechara nyocha iri ngarị. Otu ahụ machikwara ndị ọrụ asọmpi iri anọ na asaa rue ogologo afọ iri, ebe ha kagburu ebubo eboro ndị ọzọ. Nkeji Abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri ga-amasị gị taa BBC Igbo mere njem na mpaghara ọwụwanyanwụ Naịjirịa inyocha ụfọdụ ụzọ ndị gọọmenti etiti kwuru na ha na-arụ ma hụ na onweghị ndị nọ ọrụ n' ụzọ si Owere gawa Port-Harcourt. Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala Nnamani anatala akwụkwọ mmasị Ndị uweojii nwụchịrị Nnamani n'afọ 2017 Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na aka chịburu Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani, anarala akwụkwọ mmasị ịzọ ọchịchị. Ọ chọrọ ịzọ oche nnọchite Enugwu East n'ụlọomeiwu ukwu, n'okpuru otu PDP. Idemmiri emeela Kogi steeti ịwa Aka na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello, akpọkuola gọomentị etiti ka ọ gbatara ndị steeti ya ọsọ enyemaka maka idemmiri na-enye ha nsogbu. O kwuru na idemmiri a metụtara ihe ruru obodo narị abụọ dị n'ime okpuru ọchịchị iri na steeti ahụ, karịrị nke ha hụrụ n'afọ 2012. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri eriela ụfọdụ obodo na Kogi steeti N'akụkọ yiri ya, Oke ifufe na idemmiri ka na-enye mba Amerịka nsogbu. Agbapụtala ụfọdụ ndị mmadụ n'idemmiri obodo Nọt Karolaịna Ebe ọ kwụ ugbua, Ifufe Florence a ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa, ebe mmiri akwụsịbeghị izo n'ụfọdụ obodo dị na Nọt Karolaịna kamgbe ụbọchị anọ gara aga. N'egwuregwu, Otu atọ apụọla n'asọmpi bọọlụ nke Iko Aiteo a na-agba na Naịjirịa. Ifeanyi Ubah FC buliri iko a n'afọ 2016, Niger Tornadoes buliri ya n'afọ 2017 na Go Round FC, bụ otu ndị a gbapụrụ n'agba mbụ nke asọmpi a. Gere nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50285635,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50285635,Anambra Floods : Idemmiri a akarịala aka anyị - SEMA Anambra steeti,"Dịka udu mmiri na akwado ụla, ụfọdụ ndị na-eme njikere maka ide mmiri na-awakpo ha.","Nke a na-abịa dịka ndị Mba Kamerun mepere ọdọ mmiri dam ha nke Lagdo were mee ka mmiri sọfee karịa. Dika onyeisi ndị ngalaba gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' ( NEMA) nke mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Fred Anusiem gwara BBC na ndị mba Kamerụm agwaghị Naijirịa na ha emepela ọdọmmiri dam ha. Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha. Ọ bụ Adamawa, Taraba, Benue,Kogi, Anambra, Bayelsa,Rivas, Edo na Delta Steeti ka idemmiri a ga-emetụta maka na ha nọ na ikpere mmiri Benue. Ọ mere ka anyị ghọta na idemmiri a ga-esite Taraba steeti, banye Benue were si Benue gbabanye Lokoja ma gafee Delta, Anambra, Rivers na Bayelsa tụpụ ọ banye oshimiri Atlantik. 'Mmiri gbagburu ụmụakwụkwọ abụọ na Mahadum anyị' O kwukwara na ọ bụ ndị 'State Emergency Management Agency' (SEMA) ka ọ dịrị ikpọpụ ndị obodo ide mmiri a metụtara. Dịka ọ sị kọwa na ọ bụ ọrụ ha inyere ndị idemmiri a metutara aka ime ka ihe oriri na ihe ndị ọzọ ruo ha aka. Ihe ndị gbatagbata (SEMA) Anambra steeti nwere ikwu Onye na-ekwuchitere ndị SEMA Anambra steeti bụ Chukwudi Onyejekwe gwara BBC na Idemiri a erutela 'Anambra East' na 'Anambra west'. Onyejekwe kwuru na idemmiri a awakpola ebe niile dị na Anambra west. Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị' Dịka o si kwuo, "" Ihe a bụ ugboro abụọ idemmiri a na-awakpo mpaghara ndị n'afo a, mana nke abụọ a sitere Kamerun ma na-abịa n'ike n'ike."" O kwuru na ha na-edu ndị idemmiri a metutara agbaga ebe nchekwa. E be nchekwa ndị a gunyere - Na ebe ndị ọzọ. Onyejekwe gwara BBC na nke a akarịala nke gọomenti steeti ga-ebunwu. Okwuru na ha agwala ngalaba gọọmenti etiti bụ NEMA ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. Kedu ihe ndị SEMA ga-eme? Mazi Fred Anusiem kwukwara na ha enwetala ozi ndị SEMA maka Ide mmiri na-awakpo ha n'Anambra steeti. O kwukwara na ha ezigarala ndi isiọrụ ha ozi ma na-eche ka ha zaghachi ha n'ime abalị ole na-abianụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44245098,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44245098,Ọkaikpe enyela iwu ka a chọwa Innoson,Otu ọkaikpe pụrụiche n'Ikeja dị na Legos bụ Mojisola Dada enyela iwu ka a chọwa onyeisi ụlọọrụ Innoson Nigeria Limited bụ Innocent Chukwuma.,"Innocent Chukwuma Mkpebi a bụ maka na Maazị Chukwuma apụtaghị n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe ebubo ụfọdụ e boro ya. Ọkaikpe ahụ mere mkpebi ahụ oge o kwetaghị ka e wetuo akwụkwọ ọkaiwu Chukwuma bụ George Uwechue dere ịnwale ikike ụlọikpe ahụ. Mana onyeisi Innoson egosikwaghi n'ikpe a kpọrọ ya na mbụ n'ọnwa Jenuwarị 17, Feburuwarị 9, Maachị 14 na Epureel 25. Nke a bụ nke ugbo ise Maazị Chukwuma na-egosibeghi onwe nye ụlọikpe ahụ. Ndị EFCC kpụpụrụ Chukwuma n'ụlọikpe n'ebubo anọ gunyere iji aghụghọ nweta akụnaụba, izuohi na ime akwụkwọ n'ụzọ na-ezighiezi. EFCC kwuru na Innoson site n'aghụghọ na ụzọ n'akwụghị ọtọ gbara izu ọjọọ jiri aghụghọ wee nara igbe ngwọ ahịa bu ngwọọrụ e ji arụ ọgba tum tum, na ihe ndị ọzọ e ji arụ ụgbọ nke ndị ụlọakụ Guaranty Trust site n'aka Mitsui OSK dị n'Apapa Legos. Na mbụ, Innoson gọnarịrị ebubo ọbụla ma kwuo na ya na-ekpesa ikpe ahụ a na-ekpe kamgbe. N'aka nkeọzọ, BBC Igbo gbalịrị inweta Innoson na ndị ọrụ ya ka ha tinye ọnụ n'okwu ọhụrụ a mana ha azaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49525290,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49525290,Kenneth Udeze: Ndi uweojii akpọbeghi okwu aha maka ntọrị asị na a tọrọ nwaamadị a,Ndị uweojii ekwuola na ha na-achọ ndị tọrọ onyeisi otu AA bụ Kenneth Udeze n'Abuja n'ụtụtụ Fraide.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abuja bụ Frank Mba ekweghị ekwu ma ya bụ akụkọ ọ bụ eziokwu. Mana oge BBC Igbo kpọghachiri ya, o kwuru na ọ bụghị ya ka ọ dịrị ikwu maka ya bụ ihe. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ DSP Anjugurijesse Manzah gwara BBC Igbo na ha nụrụ ya bụ akụkọ dịka anyị siri nụ ya na o nwebeghị ndị wetara ha mkpesa. ""Mana anyị ezigaala ndị ọrụ anyị ebe ihe ahụ mere."" Ndị amaghị ndị ha bụ tọrọ Udeze n'ihu ụlọ anyị achọghị ikpọ aha ya n'Dutse dị n'Abuja. Oge BBC Igbo kpọrọ ekwenti Udeze, ọ kụrụ mana a gbanyụrụ ya nkwa nkwa ọ kụrụ. Maazi Udese bụ onye onyeisi pati Action Alliance nke Uche Nwosu nọ n'okpuru ha zọọ oche gọvanọ steeti Imo. Lee ihe okwuru maka ọnọdụ ndị Igbo mgbe ya na BBC Igbo nwere mkaprịta ụka. ""Ndigbo abịaghị ile ihe nkiri na Naijria."" N'Afrịka Ndị uweojii na achịkọta okporoụzọ ga ebido jiwe egbe maka nchekwa Ghana enyela ndị uweojii na-ahịkọa okporoụzọ ha ikike ibu egbe dịka egburula ndị uweojii okporoụzọ ise n'otu ọnwa na mba ahụ. Otu nwantakịrị nwaanyị bụ onye Congo DR dị afọ itolu anwuola n'aka oria Ebola na mba Uganda dịka mmadụ ole nwụrụ la n'ọ®ịa ahụ na na mba kụ®ụ puku abụọ. N'Egwuregwu Ụmụ ụwa ọkachasị otu nwere ihe jịkọrọ ha na egwu bọọlụ UEfa, Manchester United etiela onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique aka n'obi maka ọnwụ nwa nwaanyị Xana, ada Luis Enrique onye nwụrụ site ọrịa kansa dị afọ itoolu. Nkeji Akụkọ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48244144,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48244144,Tunde Bakare: Onye ji Miyetti Allah tụnyere Ọhaneze na Afenifere ejighi uche ya,Onye ji Miyetti Allah tụnyere Ọ haneze na Afenifere ejighị uche ya- Bakare,"Akụkọ dị mkpa taa: Pastọ Tunde Bakare, onyeisi ụka Latter Rain Assembly ekwuola na iji Miyetti Allah tụnyere Ọhaneze maọbụ Afenifere bụ 'ihe ihere.' Cheta na n'izu gara aga, ọnụ na-ekwuru onyeisislala Muhammadu Buhari nọọ nmkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels kwuo na Miyetti na Allah na Ọhaneze na Afeniferi bu otu ihe. Bakare kwuru nke o ge o na-ezi ozi ọma n'ụlọụka ya kwuru na ihe kacha mee ya ihe ihere bụ na onye kwuru ya bụ okwu gụpụrụ 'Arewa Consultative Forum bu otu na-anochite ndị Ugwu. ""Ọ bụ ihe ihere na mmadụ ji Miyetti Allah tụnyere Afenifere. Onye siri na Miyetti Allah na Afenifere na Ohaneze bu otu ihe bụ onye ejighị uche ya."" ""Kedu ka ị ga-asị na otu United Nation kporo otu nwere ogogo anọ ndị kachasị egbu mmadụ na Afenifere bu otu?"" ""Kedụ ka otu na-egbusi ndị mmadụ, wakpo ụmụnwaanyị , mebie ụlọ ndị mmadụ na Afenifere siri buru otu? Afenifere ọ na-ebu ngwaọgụ?"" Bakare kwuru na ụlọrụ onyeisiala ịhapụ ịkpọta aha Afrewa Consultative Forum bụ ihe e doro anya mee. Bakare gara n'ihu kwuo na ndị ohi, ndị omekome ndị ohi ehi nakwa ndị ochiehi egbu isi na-akpazi ike na Naijiria dịka ha bụzị ọchịagha(commander-in-chief) ala Naijiria. Gọvanọ Okezie Ikpeazu ekposala ndị obi ọchịchị ya Gọvanọ na-achị Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekposala ndị obi ọchịchị ya dịka ọ na-akwado ịba n'agba nke abụọ ọchịchị n'ụbọchị ole na ole na-abịa. Mana ọ bụghị ha niile ka ọ kwụsịrị ọrụ. Ndị ga-eso ya gaa n'ihu ịrụ ọrụ gụnyere: Eziuche Ubani bụ kọmishịọna na-ahụ maka ọrụ John Okiyi Kalu bụ nke mgbasaozi Aham Uko bụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi Obinna Oriaku bụ kọmishịọna na-ahụ maka ego John Ahukannah bụ nke ahụike na Ume Kalu bụ ọkaikpe ukwu nke Steeti ahụ. N'ozi si n'aka odeakwụkwọ mgbasa ozi ya pụta, gọvanọ Ikpeazu kelere ndị a maka ọrụ ọma ha rụrụ ya nakwa Steeti ma gwa ha nyefe ihe niile ha ji rụọ ọrụ n'aka ndị ọdeakwụkwọ ukwu mịnịstrị ha. Amerika were udi ụlọọrụ a n' Abuja na Lagos Ụlọọrụ nnọchịte mba Amerịlka na Naijiria ekwuola na onye ọbụla chọrọ akwụkwọ ịba mba ahụ ga-abịa maka ajụjụọnụ n'agbanyeghị na e nyebuola ya akwụkwọ mbụ. N'ozi ha wepụtara na websait ha, Ha kwuru na 'Bido na Tuzde, Abali iri na anọ nke ọnwa Mee, afọ 2019, ụlọrụ nnochite Amerịka na Naijiria na akwụsị ịgba ajụjụ ọnụ maka ndị chọọ inwoghari akwụkwọ ikike ịbanye Amerịka nke a mara dịka usoro 'Dropbox'."" Mana ha gbara ama na ndị ziterala akwụkwọ ha site na ụlọọrụ na-ekesa akwụkwọ ozi a kpọrọ DHL n'Abuja maọbụ na Legos ndị nke ha ruterela ha aka. Na mbụ, ndị nweburu akwụkwọ ikike ịga-mba Amerịka na-ezigara ụlọọrụ akwụkwọ ịrịọ maka nnwogharị site ụlọọrụ na-ekesa akwụkwọ ozi dịka anaghị agba ha ajụjụ ọnụ tupu ha enweta nke ọhụụ ọzọ. Kpọpụtanụ Leah Sheribu - Gọv Hassan Dankwambo Dịka taa bụ ncheta afọ iri na isii a mụrụ Leah Sharibu bụ nwata nwaanyị ndị Boko Haram tọọrọ kemgbe otu afọ gara aga. Gọvanọ Gombe Steeti bụ Ibrahim Hassan Dankwambo akpọọla oku ka a tọhapụ nwata ngwangwa site n'aka Boko Haram. N'ofesi Mba Amerịka na-arụ mba Ịran aka n'ihu na ọ bụ ha ji ogbunigwe mebie ụgbọmmiri anọ na mpaghara United Arab Emirates n'ụbọchị ụka. o nwebeghi ihe akaebe na-egosi na aka ndị Ịran dị n'aya mana mba ndị ometụtara a tabeghi onwe ụta. N'egwuregwu Manchester City nọzi n'ọnụ ọnya ndị Uefa ugbua dịka a na-enyocha ha maka ebubo ịda iwu gbasara ego na-achị otu egwuregwu bọọlụ. A ga-amachi ha ịgba asọmpị Champịọns league otu afọ ma ọ bụrụ na chọpụta na ha dara iwu a n'ezie. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ' Whatsapp sị gị zụta ekwentị ọhụrụ iji gbalahụ nje ekwentị Ụlọọrụ Facebook nwe Whatsapp ekwuola na ndị mmadụ akpọbeghi aha awakpoola ekwentị ụfọdụ mmadụ Ha kwuru na ha ga-ezigara ndị ahụ ozi sị ha gbanwee Whatsapp nke dị n'ekwentị ha. Ha kwukwara na ndị ji ekwentị ""Windows"" ga-agbanwe nke ha iji gbalahụ ya bụ nje. Kedụ etu ị ga-esi gbanwe Whatsapp gị? Na iOS Onye kpụpụrụ onyesisiala ụlọikpe? Tanko na Justice fo di nation's Supreme Court Onyeisiala Muhammadu Buhari na onye ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bu Abubakar Malami jụrụ ịpụta n'ụlọikpe izara ọnụ ha. Okwu na-eche ha gbasara ọkwa ọkaikpe kachasị nke onyeisiala nyefere n'aka Tanko Mohammed. Akụkọ kwuru na o nweghi kwa ndị ọkaiwu nọchitere anya onyeisiala n'ụlọikpe ahụ. ""Obi ọjọọ ka e ji kwatu Caramelo"" Gọọmenti Abuja akwatuola ụlọ oriri na nkwarị a ma ama bụ Caramelo n'Abuja n'ụbọchị Monde. Ha kwuru na ọ bụ maka mkpọtu si ebe ahụ apụta ka ha ji kwatuo ya Ebe onye ọkaiwu bụ Goddy Uwazurike nke BBC kpọrọ n'ekwentị na-akọwa na ọ bụ obi ọjọọ ka gọọmentị Abuja jiri kwatuo ya bụ ụlọ. N'egwuregwu, Dịka a na-ege ntị ịnụ aha ndị Gernot Rohr ga-akpọpụta ga-agbara Naịjirịa n'asọmpị iko mba Afrịka, a na-atụ anya na Mikel Obi ga-eso na ya. Cheta na ahụbeghị Mikel Obi anya kemgbe Argentina meriri Naịjirịa n'asọmpị iko mba ụwa afọ gara aga. Gee Nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Agriculture in Nigeria: 'Eji m ọrụ ugbo achụ ụbịam na agụụ ọsọ ụkwụ erughi ala'" mba-uba-51425002,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-51425002,Iyana Ipaja: Kọntena si n'elu daa akwọjipula nwaanyị ụkwụ na Legọs,Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na nwaanyị aha a na-amabeghị aha ya na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ka kọntena ahụ dagidere ya kwọjipuru ya otu ụkwụ.,"Ndị ụlọorụ gbatagbata Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) agaruola Iyana Ipaja bụ ebe ihe a mere, ịma etu ha ga-esi nyere aka. Ka ọ dị ugbua, onyeisi ha bụ Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu sị na a kpọgala ya ụlọọgwụ, ma kwukwaa na ha na-agba mbọ ịwepụta ụkwụ nwaanyị ahụ n'okpuru kọntena ahụ nakwa wepụ kọntena ahụ n'ụzọ. Anyị ga-ebu ọnụ otu izu maka ọkwa Ihedioha - PDP Imo steeti Ndị otu pati PDP nke Imo steeti na-akwado ibu ọnụ na ime ekpere otu izu bido ụbọchị ụka a bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa a ruo ụbọchị iri na isii. N'akwụkwọ odeakwụkwọ pati ha bụ Nze Ray Emeana zipụrụ, o kwuru na ekpere a bụ ịrịọ Chineke ka o nyere aka mee ka Emeka Ihedioha nwetekwa oche ya dịka gọvanọ Imo steeti. Ha sịkwa ka ndị mmadụ yiri akwa ojii kwa ụbọchị ekpere a. Cheta na Ihedioha agaghachịla ụlọikpe kachasị ịma ma o nwere etu ọ ga-esi weghachịtakwa oche o si na ya pụọ. Ighalo agaghị eso Man Utd gaa Spen Odion Ighalo agaghị eso Manchester United gaa ọgbọ nkwado ha chọrọ ịga na mba Spen maka ụjọ coronavirus. Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta otu egwuregwu ahụ sị na ha achọghị ọnọdụ ọ ga-abụ na ha gaa, agaghị ekwe ya banyeghachị na Briten maka etu a ọ ka si Chaịna bịa n'izu gara aga. Onye agha ewerela egbe baa obodo gbagbuo ihe ruru mmadụ 20 E jidebeghi Jakraphanth Thomma bu onye a na-eche na ọ bụ ya kpara ike a Akụkọ si Taịland apụta na-akọwa na otu onye agha ji egbe gbagbuo mmadụ iri abụọ (20) ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ n'obodo Korat dị nso na Bangkọk. Thomma bu ụzọ gbagbuo onyeisi ya bụ Col Anantharot Krasae, tupu o zuru egbe na ngwaagha ndị ọzọ pụọ. Ihe ndị mmadụ na-etinye na soshal midia na-egosi na ọ gara n'ụlọahịa ebe ọ nọ na-agwụ ndị mmadụ. Dịka ndị uweojii siri kwuo, onye agha a zuru ụgbọala n'ọdọ ndịagha tupu o jiri egbe wakpoo ndị mmadụ na ya bụ obodo. O tinyekwara ihe onyonyo ebe ọ na-akwọ ụgbọala ahụ n'elu Facebook ya. Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ijide ya dịka e zipuru ozi ""onye a bụ onye a na-achọsi ike"" maka ya. Ọzọdịmgba anọ anwụọla Ọzọdịmgba a na-ahụ naanị n'ugwu ji naanị obere ihe gafee otu puku fọrọ n'ụwa Amụma igwe esegbuola ọzọdịmgba anọ gụnyere otu nke dị ime na mba Uganda. Ngalaba na-ahụ maka nlekọta ha bụ Greater Virunga Transboundary Collaboration (GVTC), kwuru na nke a dị mwute n'ihi na ụdịrị ọzọdịmgba a na-ahụ naanị n'ugwu ji naanị obere ihe gafee otu puku n'ụwa. 'Anyị achọghị ịhụ ndị ji ọkọrọtọ Biafra n'olili Eze Kanu' - Ndị Uweojii Dịka Olili nne na nne Nnamdi Kanu na-abịa nso, ndị uweojii n'Abịa steeti ekwusiela ike na ha achọghị ihu onye ji ọkọrọtọ Biafra maọbụ uwe ndị 'Jew' n'ebe ahụ. Ene Okon bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ etiela aka n'ala sị na ya agaghị anọ ndụ hụ ka nke ahụ mere dịka otu Ipob na-azọ iwu na ha ga-abịarịrị. N'aka ọzọ, otu ndị ntoroọbịa Ohaneze ndị Igbo arịọla ka gọọmenti gbaghara Nnamdị Kanu ka ọ nwee ike ịbata bịa lie nne ya na nna ya. Nnamdi Kanu na onwe ya tiri mkpu n'elu Twitter na ndịagha Naịjiria na-akwado ịga n'ụlọoriri na nkwari ndị dị n'Ụmụahịa, ka ha nwee ike ""ịkpụrụ ndịisi Ipob nwereike ịbata tupu e mee akwamozu"" nne na nna ya. Ndị uweojii sị na ọbụghị ogbunigwe Ndị uweojii n'Ekiti steeti ekwuola na ọ bụ ihe eji agbari ogbunigwe gbara na steeti ahụ n'ụtụtụ taata. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Asuquo Amba sị na ọ bụghị ndị omekome mere ihe a mana ha na nyocha ịmata etu o si mee. Coronavirus na Chaịna N'ofesi, Hong Kong etiela iwu ga-eme ka onye ọbụla sị mba Chaina bata obodo ahụ ga nọrọ n'ogige ebe ndị ana enyonyo maka Coronavirus ruo izuụka abụọ. Ya bụ iwu sị ndị mmadụ akwụgharịzịna, maka ịtụ ha mkpọrọ maọbụ iri ha iwu. Lagos City Marathon David Barmasai ga-erite ego dị $50,000 maka meri a N'egwuruegwu, onye mba Kenya bịara Nigeria maburu nturuugo nke mwemwe ọsọ nke Legọs Marathon agbara n'ụtụtụ a David Barmasai Tumo ji awa abụọ, nkeji iri abụọ na tịnkọm tịnkọm isii merie ya bụ ọsọ kilomita iri anọ na abụọ mgbe ọtụtụ ndị ọtụ ya ka nọ n'ụzọ. Ọ bụkwa onye Kenya ọzọ bụ Sharon Cherop tuuru ugo mwemmwe ọsọ nke ụmụnwaanyị. Onye nke abụọ na onye nke atọ na ya bụ ọsọ ga-erita $40,000 nakwa $30,000. Nke a bụ agba nke anọ ya bụ ọsọ malitere n'afọ 2016 bụ nke a na-eme na Legọs. Kemgbe amalitere ya bụ ọsọ, ndị Kenya emeriela ya ugboro atọ ebe onye Etiopia merigoro otu ugboro n'ọsọ nke ụmụnwoke. Na nke ụmụnwaany,i ndị Etiopia emeriela ugboro atọ ebe Kenya ji otu. Trump achụọla ndị iro ya n'ọrụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump achuọla Alexander Vindman na Gordon Sondland n'ọrụ. Mmadụ abụọ a so n'ime ndị zara okwu Ụlọomeiwu Nta nke Amerịka oge ha na-enyocha nrụrụaka ha boro Trump. Ọchịagha Vindman na-arụ ọrụ na obi gọọmentị Amerịka ebe Nnọchiteanya Sondaland bụ onye na-ekwuru Amerịka na Yurope. Nke a na-abịa dịka a na-ekwu na Maazị Trump chọrọ ịhazịarị ndị ọrụ ya dịka ndi Omeiwu Ukwu kpebiri na onweghi arụ ọ kpara. Onyeisiala Muhammedu Buharị nọ Ethiopia maka ọgbakọ Ụmụibe Onyeisiala Muhammadu Buhari anwuchiela mba Ethiopia ụnyahụ maka nzụkọ ndị isi mba Africa. Mba iri anọ so eme ya bụ ọgbako ukwu akpọrọ maka ọdịmma ndị Afrịrịka Ego Abacha Ụnyaahụ bụ Fraịde ka ụlọikpe ukwu na Naịjirịa tụghapụrụ arịrịọ ezenaulo na-arịọ ka enye ha ohere ibitu ego otinyere n'ụlọakụ na Briten, Switerzland, Jersey, Liechtenstein nakwa Luxembourg. Gaurdiola sị na anya ya adịghị na Messi Pep Guardiola bụ onye bubu onye nchịkọta otu Bayern Munich N'egwuruegwu, Pep Gaurdiola nke Manchester City ekwuola na ya anaghị atụanya Lionel Messi isonyere ya na otuegwuruegwu ya. Messi na otu onyeisi ha bụ Eric Abidal na-enwe nghọtahie na Barcalona nke ndị mmadụ na-atụ anya na o nwere ike ịpu na otu ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" institutional-49359795,https://www.bbc.com/igbo/institutional-49359795,Igbo festivals: Iri ji Mbaise agbajuola dọrọ tata,Mmemme Iri Ji Mbaise na-akpọtụ ugbua n'ụlọakwụkwọ 'Aboh Mbaise Secondary School' ebe obodo 91 mejupụtara Mbaise na-eri ji ọhụrụ taa bụ Tọzde.,"Gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo steeti so waa ji na mmemme iri ji ndị Mbaise mere na nso nso a Ji nọ n'ọkụ na-eghe Iri ji Mbaise bụ nke a na-eme kwa afọ ọbụla ma ọnwa August gbaa iri na ise. Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha tụrụ 'down' na Iri ji Aboh Mbaise Mmadụ puku kwụrụ puku zukọtara kemgbe ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe ndị mbaise na egosi ejiri mara ha. Ụmụada Mbaise gwunyere n'emume iri ji ahụ Ndị Eze-ji Mbaise Mbaise na afọ a Ndị Eze-Ji niile bugasi ji gbara agba si na obaji ha bịa gosi ya ka ụwa kirie. Ndị Eze-ji Mbaise nọ n'ihu ọba ji egosiputa aka ọrụ ha n'Iri Ji mbaise 2019 Eze-Ji HRH Eze Mike Ndudiri Orji kwuru na obodo Mbaise bụ ndị kasi ibe ha akọpụta ji, nke mere na ha na ebu ụzọ eme mmemme iri ji tupu obodo ndị ọzọ eriwe. Ndị otu egwu dị icheiche mere ka emume iri ji ahụ kpoo ọkụ Ihe nkiri omenala juputara na iri ji Mbaise nke afọa gụnyere egwu omenala dị iche iche, ịgba mgba, ekike, ịgosi ọba ji nakwa ihe ndị ọzọ. Lee ihe nkiri iri iji nke ndị mba ọzọ: Ndị Abatete n'Anambra steeti mere ihe puruiche na mme mme iri ha Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ Iri Ji ndị Igbo na Sweden Lee akuko ga-amasị gị" egwuregwu-50227966,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50227966,Golden Eaglets na nnụnụ ndị ọzọ feterela Naịjirịa ntụrụugo na bọọlụ,"N'ihi na egwuregwu bọọlụ so n'otu ihe na-ejikọ ndị agbụrụ Naịjirịa niile, ọ pụtara na njikọ ahụ na-akacha mma mgbe ihe nrite so ya.","A bịa n'ihe gbasara egwuregwu, ndị Naịjiria anaghị eji ya achị, nke bụ na e nwere ike too gị ka dike taa, mana echi ị bụrụ 'onye chi ọjọọ' nye ha, ọkachasị ma a hụta na ị metara ihe e ji gbapụ Naịjirịa n'asọmpi. Mana n'ime ihe niile, enweghị ihe na-atọ ndị Naịjirịa ụtọ dịka mmeri, ọkachasị mgbe ọ bụ na mba. Ngwa lee ka ịhụ etu BBC Igbo si chịkọta otu egwuregwu bọolụ Naịjirịa ndị kacharala bulie iko asọmpi, ole ha nweterela na mgbe ha nwetara ha. Ndị Golden Eaglets Otu Golden Eaglets bụ mba kacharala bulie Iko Mbaụwa nke ndị U-17 A bịa na Naịjirịa, ndị a ma dịka ""Golden Eaglets"" bụ ndị ọgbabọọlụ na-akarịghị afọ 17, bụ ndị kacharala metụ iko asọmpi bọọlụ aka. Ha ebuliela iko ugboro asatọ (8); gụnyere iko mbaụwa ise (5), iko mba Afrịka abụọ (2) nakwa otu iko UEFA-CAF Meridian (1) bụ nke ha buliri n'afọ 1997. Ha buliri nke mbaụwa n'afọ 1985, 1993, 2007, 2013 na 2015. Ha buliri nke mpaghara Afrịka n'afọ 2001 na 2007. Ndị Dream Team Naịjirịa nwetara nturuugo ọlaedo n'egwuregwu n'afọ 1996 Ndị ""Dream Team"" bụ ndị na-akarịghị afọ 23 (a na-enye ohere ịkpọ mmadụ atọ karịrị afọ 23), ma bụrụkwa otu Naịjirịa na-akpọ aga asọmpi Olimpiks. Dream Team ritere ọlaedo n'afọ 1996, ọlaọcha n'afọ 2008, ma rite ọlanchara n'afọ 2016. Nke a mere ka Naịjirịa bụrụ mba mbụ si mpaghara Afrịka nweterela ọla atọ a na-enye n'asọmpi bọọlụ nke Olimpiks. Ha mabutekwara iko mpaghara Afrịka n'afọ 2015. Ndị Super Falcons Super Falcons egosila mpaghara Afrịka ugboro ugboro na ha bụ dike n'egwuregwu bọọlụ Ndị Super Falcons so na ndị kacha etinye ọchị n'ọnụ ndị Naịjirịa ma a bịa n'egwuregwu. Ha amaburula Iko mpaghara Afrịka ugboro itoolu (9) kemgbe ha malitere isonye n'asọmpi a. Ha buliri Iko Mpaghara Afrịka n'afọ 1991, 1995 mgbe ọ ka bụ asọmpi egwuregwu ụmụnwaanyị Afrịka nke CAF (CAF African Women's Championship). Mgbe a malitere ịkpọ ya Africa Women Cup Of Nations (AWCON) ha buliri iko a n'afọ 1998, 2000, 2002, 2004, 2006, 2010, 2014, 2016 nakwa 2018. Ha ebulikwaala iko WAFU Zone B n'afọ 2019. Ha enwetakwala ọlaedo n'asọmpi All Afrịca Games ugboro abụọ, 2003 na 2007. Ndị Super Eagles Ikpeazụ Naịjirịa buliri iko mba Afrịka bụ n'afọ 2013 A bịa n'egwuregwu na Naịjirịa, ọ na-adị ka ọ bụ nke ndị Super Eagles na-akacha amasị ndị Naịjirịa itinye anya ma na-esokwa. Ya bụ nke na-akacha ewu, makana ọ bụ ha bụ nke onye ọbụla ga-esonyenwu n'agbanyeghị afọ ole ọbụla ị dị; nke bụ na ị ga-enwe ohere ịhụ ndị ị na-akwado n'egwuregwu nke klọb. Super Eagles ebuola Iko mpaghara Afrịka ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 nakwa 2013. Ha ebulikwaala Iko nke a na-akpọ ""WAFU Nations Cup"" bụ maka mba ndị si mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka n'afọ 2010. Ndị Flying Eagles Flying Eagles bụ ndị nke na-akarịghị afọ 20 na-agbara Naịjirịa bọọlụ. Ha ebuliele iko mba Afrịka ugboro asaa; n'afọ 1980, 1985, 1989, 2005, 2011 nakwa 2015. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" egwuregwu-44343246,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44343246,England Vs Naịjirịa: Iwuobi e gosi na ọ bụ nwanne Okocha,N'asọmpi enyi na enyi Naịjirịa na England gbara taa Naịjirịa gbaliri ike ha agbanyeghi na e meriri ha.,"Alex Iwobi bụ onye mbụ na-enye mba England goolu na Naịjirịa England ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Naịjirịa dịka Garry cahill na Harry Kane nyere ndị goolụ ndị England, Alex Iwobi nyere Naịjirịa goolu. N'ime asọmpi ahụ ụmụ afọ Naịjirịa gbapụtara ihe bụ Alex Iwobi na Victor Moses maka ihe pụrụiche ha mere. Iwobi bụ onye gbara bọọlụ nke ọma ma nyere ndị Naịjirịa otu ọkpụ goolu ha nwetere ma bụrụ onye mbụ na-enye mba England goolu na Naịjirịa. End of Twitter post, 1 Nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-eto ya maka, kwuo n'ezie na ọ bụ nwanne Austin Okocha gbara bọọlụ n'oge mbụ Victor Moses kpara Harry Kane ịkpa dị egwu nke mere aka ya na ikpere ji ruo ala ma. Ịkpa mere ọtụtụ ndị ji na-ekwu na Moses agbajiela Kane ụkwụ n'akara twitter ha." afirika-49247436,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49247436,Enugu Security: Kedụ ndị bụ 'Forest Rangers' a Enugu Steeti na-achọ ihiwe?,Nchekwa ndụ na akụnaụba obodo bụ oke na ọrụ dịrị gọọmentị etiti nakwa nke steeti ọbụla.,"A bịa na Naịjirịa e nwere ngalaba nchekwa dị icheiche gụnyere Ndịagha, ndị uweojii na ndị nchekwa ọdịnala dgz. Gọọmentị Enugwu Steeti ehiwere ngalaba nchekwa a kpọrọ 'Forest Rangers' iji chekwaa steeti ha site n'aka ndị mpụ na omekome. Kedụ ndị bụ 'Forest Rangers'? Otu onye ọkachamara n'okwu nchekwa ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ nchekwa 'Spider Security' bụ Uzoma Anyakora kwuru na 'Forest guards' bụ; Gịnị bụ ọrụ ndị 'Forest Rangers'? Uzoma Anyakora kwuru na ọrụ ndị a gụnyere; Anyakora gara n'ihu kwuo na ihiwe ụdị nchekwa ga-enye aka ibelata oke mpụ, ohi na ntọrị mmadụ dị ugbua. Cheta na ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa gụnyere n'Enugwu Steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44676794,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44676794,Ọkụ Otedọla: Gọọmentị Lagos achụfeela ụgbọala tanka n'otu ụzọ,Gọọmentị Legọs steeti ekwupụtala ihe ha chọpụtara na nyocha ha mere gbasara ọkụ ụgbọala tanka gbara ma gbuo ihe ruru mmadụ 9 ma gbaa ụgbọala 54 ọkụ n'akwa Otedola n'izu gara aga.,"Ladi Lawanson bụ kọmishọna na-ahụ maka njem, kwuru sị na ihe ha chọpụtara bụ na tanka ahụ gbara ọkụ bu ibu karịrị ihe o kwesịrị ibu. Lawanson kwuru sị ""anyị chọpụtara na a rụrụ tanka ahụ n'afọ 1999 na mba Amerịka, mana ndị Naịjirịa rụgharịrị ya site n'ịbụ ihe bekee kpọrọ 'drilling rig' mezia ka ọ bụrụ ihe e ji ebu mmanụ ụgbọala. A rụrụ ya ka ọ ghara ibu ibu karịrị tọn 15, mana ihe o bu bụ tọn 30."" O kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke Habib Aruna bụ ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị binyere aka. Gọọmentị Legọs kwuru n'akwụkọ ozi ahụ sị na iwu bụ na ụgbọala gwongworo maọbụ tanka ọbụla na-abata Legọs ga-enwerịrị asambodo gosiri na ahụ dị ya mma, nke ga-esi n'aka mịnịstrị na-ahụ maka njem, n'ime ụbọchị iri atọ na-abịa. Gọọmentị Legọs steeti kwuputakwara na site ugbua gawa n'ihu, na tanka niile na-ebu mmanụ ụgbọala ga-ebido ịga naanị n'okporoụzọ a rụrụ maka ha nke bụ Apapa-Oworonshoki, nke si Ogudu gafee okporoụzọ Legọs-Ibadan. Lawanson kwukwara na a chọpụtara na tanka ahụ gbara ọkụ esila n'aka fere n'aka ugboro 13 kemgbe ọ batara Naịjirịa. Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na otu onye n'ime mmadụ anọ so na ndị merụrụ ahụ ha zọpụtara n'ọkụ ahụ anwụọla. Ndị ọnụ na-eru n'okwu bịara ọgbakọ a gụnyere ndị si otu 'Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers', otu 'Association of Maritime Truck Owners', nke 'Petroleum Tanker Drivers', nke 'National Association of Transport Operators', nakwa 'Container Truck Owners Association of Nigeria'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46209685,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46209685,Abaribe ha a ga-akwụ ụlọikpe N100m?,Akụkọ na-eru anyị ntị site n'ụlọikpe ukwu di n'Abuja na-akọwa na ọkaikpe Binta Nyako enyela iwu ka ego Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ jiri gbara Nnamdi Kanu aka ebe baa n'akpa ụlọikpe.,"Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji nye Nnamdi Kanu n'aka Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ n'ọnwa Eprelụ nke 2017. Mgbe ahụ, Abaribe, Tochukwu Uchendu na Immauel Shalom ji akwụkwọ akụnaụba ha nara Maazị Kanu n'aka ụlọikpe. Ugbua, Ọkaikpe Nyako sị ka ha kwụnye nde narị naira (100 million) n'ụlọakụ ụlọikpe. BBC gbara otu onye metụtara Abaribe ajụjụ ọnụ maka mkpebi a, o were sị na onweghi ihe ngbagwojuanya dị na ya maka na ikpe ka na-aga n'ihu. ""Anyị aghaghị itinye ọnụ n'okwu a karịa ikwu na ikpe ka na-aga n'ihu. Ọ bụ ubọchị 28 nke Mach 2019 ka a ga-alaghachi ụlọikpe maka ya a."" Ọkaikpe Nyako kwuru na ọbụghị Abaribe na ndị ọzọ a ka ọ na-ekpe ikpe. ""Ihe m chọrọ bụ ka ha kpọpụtara m Nnamdi Kanu,"" Nyako kwuru mgbe ọ kpere ikpe taa. Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi. Iwu ya bụ na Abaribe na mmadụ abụọ a nwere ọnwa abụọ iji kwunye ego a. Cheta na ebidoro ịchọ Kanu ka ndi agha Naịjirịa na ụfọdụ ndị na-akwado ya kwakọrọ isi na be ya n'afọ 2017. Ndị Ipob, bu otu Kanu nọ n'isi ha, kwuru na mmadụ 28 nwụru mgbe ndị agha wakporo be ya. Ndị agha kwuru na nke a abụghi eziokwu. Kanu n'onwe ya sị na ọ bụ egwu na ndi agha ga egbu ya mere ojiri gbaa ọsọ. Ọ sị na ya nọ Izrel ugbua, ma kwukwa na ya chọrọ ịlọta bịa zara ọnụ n'aka Binta Nyako, ""ma ọ ọbụru na mba ụwa ga-ekwe nkwa na ikpe m ga akwu ọtọ"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48689383,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689383,"Fulani Herdsmen: ""Ahụla m ihe na-adọhachị ndịagha azụ na'ọrụ nchekwa """,Ọchịagha ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai ekwuola ihe mere agha a na-ebuso ndị ọmekataraihepụụjọ ekweghị ebi ebi.,"Buratai ekwuola ebe nsogbu ya sị O sị na ọ bụ gịnị mere ya? Buratai sị na ụfọdụ ndị ọrụ ya anaghị etinye ezi uchu n'ọrụ dịka okwesiri ma gwakwa ndị ọbụla nke a metutera ha nye efe n'ọrụ mgbe oge ka dí. Maka iwu onye apụla ezi na Taraba steeti Ndị agha Naijiria ka na-ebuso ndị Boko Haram ọgwụ Na Taraba steeti, gọmenti steeti ahụ amaala iwu onye apụla ezi site elekere anọ nke mgbe ruo n'elekere isii nke ụtụtụ. Nke a bụ maka mwakpọ ndị oji egbe achi ehi nke tara isi mmadụ iri na asatọ ụbọchị Monde. Trump amalitela nta vootu Igbo sị na emee ngwa ngwa emeghere ọdachi, ha mere Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ji malite achụmnta vote maka ntuliaka nke onyeisiala nke 2020. Trump rịọrọ ndị Florida bụ ebe ọ nọ kwuo nke a, ka ha biko kwado ya ma jiri votu ha chekwa gọmentị ya. Platini na-azara ọnụ ya n'ụlọọrụ mpụ na ngarị mba France N'egwuruegwu, a na-agba Michel Platini ajụjụ ọnụ ka ọ kọwaa ihe mere e ji bugaa iko mbaụwa nke 2022 Qatar agbanyeghị na mba ahụ etozughị etozu. Ụlọọrụ na ahụ maka nrụrụaka na-enyocha ya bụ mkpebi ka ha mata ka aka enwe sị bata na ya bụ ofe. Chete na amachiri Platini dịka onyenchịkọta egwuruegwu ndị Urop kemgbe afọ 2015 maka ebubo ụrụaka. Gee Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasi gị" afirika-52617561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52617561,Imo state: Ihedioha agbaghala nyocha gọọmentị Imo steeti chọrọ ime ya,Onye bụbu Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha agbaghaala nyocha gọọmentị steeti ahụ chọrọ ịme ya n'ụlọikpe.,"Akwụkwọ ya kọwara na ọ bụghị Gọvanọ ka iwu dere ga-eme ụdịrị nyocha ahụ ma kwukwa na dịka iwu si kwuo. O kwukwara na e kwesiri ịnye gọọmentị mpụtara mmefu ego steeti ahu kwa afọ bụ Annual Audit report na Bekee tupu ha e mee nyocha ọbụla. Cheta na Hope Uzodimma na-achị Imo steeti kwuru na ihe ruru nde iri na isii furu efu n'akpaego steeti ahụ. Rivas steeti ekutula ume ndụ Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike ekwuola na a ga-amalite ịmepetu steeti ahụ inye ndị mmadụ ohere igo nri na ọgwụ. Ohere ngagharị ga-amalite n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee ma kwụsị n'abalị ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Mee. Gịnị na-eme n'egwuregwu na mba Briten? Gọọmentị mba Briten ekwuola na o nweghi egwuregwu ọbụla a ga-eme n'ala ha rue opekatampe ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun. Nke a na-abịa dịka ndị isi egwuregwu bọọlụ na-enwe nzụkọ ịma etu ha ga-esi malite egwuregwu ọzọ n'ihu ọrịa Coronavirus. Mmadụ 20 anwụọla n'otu obodo a wakporo dị n'akụkụ Naịjirịa Gọvanọ na-achị obodo Tillaberi na mba Niger aha ya bụ Tidjani Ibrahim Katiella ekwuola na ndị ọra ọbara bu ọgbatumtum batara obodo bia kpaa mkpa mkpa a. Otu ọjọ a na-amabeghị ndị ha bụ tikasịrị ụlọ ahịa ndị mmadụ, zuru ewu na ọkụkọ ma were ike gwa ndị obodo ahụ ka ha gbalaga. Kamgbe afọ 2017 ka e tinyere ọnọdụ gbata gbata n'obodo Tillaberi ya na mba Mali, Burkina Faso na Benin nwere oke. Obodo niile edepụtara ebe a na ndị omekome Jihadist na-akwata ya kamgbe. Ndị nọ mgbe ịhe a mere na-ekwu na o mere n'elekere anọ nke mgbede dịka ndị ahụ bu egbe na-ede obodo dịka Gadabo na Koira Teguio. Nyerenu gọọmentị aka chọta ihe na-egbu mmadụ na Yobe - Lawan Ahmed Lawan Ahmed Lawan bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa etiela ndị Yobe steeti aka n'obi maka ọnwụ gburu ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ. Ọ dụkwara ndị obodo ọnwụ a na-akpa ike na ya ka ha nyere gọọmentị aka na mbọ ha na-agba ịchọpụta ihe na-egbu ndị mmadụ ka aja ebe ahụ. Na Saụt Afrịka Ndị na-ama aka ọchịchị na mba Saụt Afrịka na-aba mba maka etu e si machie ire mmanya na anwụrụ a na-ese ese dịka ha nọ na mmechi obodo. John Steenkamp bụ onyeisi Democratic Alliance kwuru na mmachi a na-anapụ gọọmentị ọtụtụ ego ha kwesịrị irite n'ụtụisi ma na-etinye ya n'akpa ndị na-ezo ezo ere ya. Saudi Arebia etinyekwuola VAT Nwoke na-agụ ego ndị mba Saudi bụ Riyal Mba Saudi Arabia ekwuola na ha ga-ebuli ụgwọ VAT ha site na pasentị ise ruo pasentị iri na ise site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị. N'otu aka ahụ, ha kwukwara na bido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun, na ha ga-akwụsị inye ha ego nkwado obibi ndụ ha malitere inye ha kemgbe afọ 2018. Man Utd azụla Ighalo - Neville Gary Neville gbaburu Manchester United bọọlụ adọọla Ole Gunna Solskjaer bụ onye nchịkọta otu ahụ aka na ntị ka ọ ghara ịzụ Odion Ighalo. Neville kwuru na o cheghi na Ighalo tozuru ka a kwụọ nde paụnd iri abụọ n'isi ya, ọkachasị maka etu ihe dị ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45460720,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45460720,Boko Haram akpachiela obodo ọzọ na Borno steeti,"N'ime elekere ole na ole ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha gbasara ndị Boko Haram nọ n'ime ọhịa Sambisa, ndị Boko Haram pụtara n'ike ma wakpo obodo ọzọ.","Ndị a wakporo obodo Gudumbali dị na Guzamala nke Borno steeti n'ụtụtụ taa, chufuo ndị agha nọ n'ebe ahụ ma kpachie ọgbe ha. Ndị agha ọdịnala gwara ndị ntaakụkọ AFP na ihe ruru mmadụ asatọ nwụrụ na mwakpo aahụ emere. Boko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ Mwakpo na-abịa dịka gọọmenti kpọrọ oku ka ndị niile achụpụrụ lọghachite n'obodo ha. Onye ọrụ ọchịchọ obodo Guzamala kwuru na mwakpo a bụ eziokwu ma kwuo na ndị jizi ọchịchị obodo ahụ ugbua. Otu onye ọrụ nchekwa onye agha kwuru ndị a bara n'elekere asatọ nke abalị ụnyaahụ ma gbasuo ndị agha egbe rute n'isi ụtụtụ taa, bụ nke mere ndị agha jiri gbaa ọsọ. O kwuru na ọ maghị mmadụ ole ha gburu na mwakpo ahụ. Onye obodo akpọrọ Musa Ari kwuru na ọ bụ ndị agha ka ndị Boko Haram a bịara ịwakpo na ọ bụghị ndị bi n'obodo. Ari kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ ka ha gburu bụ ndị na-agara ndị agha ozi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44804060,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44804060,Omenaala Igbo ọ ga-ekwe nwoke zaa aha nwunye ya?,"Onye mba Afrịka chọọ ịza aha nna nwunye ya, e nwere ike ịchị ya ọchị maka mkpebi o mere, maka na ọ bụghị ihe ntị na-anụkarị na mpaghara a.","Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu Ndị Afrịka ọkachasị ndị Igbo, na-ewere ya na ọ bụ ezigbo ihe ka nwaanyị gosi na ọ lụọla di ma o bido ịza aha di ya. Naanị ọbere pasentị ndị mmadụ bụ ndị na-anaghị atụgharị aha e ji mara ha tupu ha alụọ di, ebe ọbere pasentị bụkwa ndị na-etinyekọta aha di ha na nke nna ha ọnụ. Nwoke ọ ga-aza aha nna nwunye ya n'ala Igbo? Ọ bụghị omenaala ndị Igbo na nwaanyị ga-aza aha di ya dịka usoro Bekee na-akpọ 'surname' mgbe gboo, mana ugbua, ndị Igbo anabatala usoro Bekee ji eme ya. Nwaanyị na azazị aha di ya, mere o ji bụrụzịa omenaala nke ọgbara ọhụrụ. Ya mere, ọ ga-abụ ihe mgbawoju anya ma nwoke Igbo sị na ọ bụ aha nna nwunye ya ka ọ ga-aza. Ndị ụmụnna ya nwere ike inyocha ya ka ha nwee ike ibo nwunye ya ebubo na o ji ọgwụ kechie ya. Ha nwekwara ike iwe ya na ọ gọpụla onwe ya n'ezinaụlọ ha, ma bụrụzịa onye ezinaụlọ nwunye ya. Ajụjụ dị iche iche bụ ihe ụmụnna ya ga-akpụ n'ọnụ dị ka: Mana, mgbe ochie, e nwereike jiri aha nwaanyị a ma ama, mara di ya. Ọmụmaatụ: Ọ bụru na ""Nwaanyị Ọcha"" bụ nwunye Okechukwu, ma bụrụkwa onye a ma ama, a ga amaatụ Okechukwu ka ""Okechukwu Nwaanyị ọcha"". Nke bụ etu Igbo ji akpọ aha. Ya mere onye odee akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngọzị Adichie jiri kwuo na ""aha nna"" adịghị oke mkpa n'ala Igbo na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere. O kwuru nke a oge a jụrụ ya ihe kpatara o ji aza aha nna ya n'agbanyeghị na ọ lụọla di. Ọ sị na ụfọdụ ndị na-ekwu na enweghị ihe o ji omenaala Igbo kpọrọ kpatara o ji ọnaghị aza aha di ya; mana ""ha amaghị na n'ezie 'aha nna' adịbughi n'ala Igbo mgbe gboo, ọ bụ ndị Bekee wetere ya"". Ihe ndị mmadụ kwuru maka ịza aha nwunye ha BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ọnọdụ nwere ike ime ka ha zaa aha nna nwunye ha, lee ihe ha kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43904587,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43904587,Akụkọkachasị n'ụtụtụ a: Kanye West sịrị na Donald Trump bụ nwanne ya,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Donald Trump ekelela Kanye West,"Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump atụpụrụla oti egwu bụ Kanye West ekele pụrụiche maka ịkwado ya. Kanye West dị mbụ kwuo na ndị mmadụ agaghị egbochi ya ihụ Trump n'anya bụ onye ọkọwara dịka Nwanne ya nwoke. Gọọmentị etiti ehiwela ngalaba na-ahụ maka iji mgbọrọọgwụ agwọ ọrịa ịba Ndị na-ere mgbọrọ ọgwụ na mkpa akwụkwọ onwereike ị nọ n'ofe ugbu a dịka Gọọmentị etiti etinyeala aka n'akwụkwọ ihiwe ngalaba na-ahụ maka iji ọgwụ ọdịnala agwọ ọrịa ịba. Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Isaac Adewole kwupụtara nke a mgbe ndị isi ọchịchị nwechara mkparịta ụka ụnyaahụ. MASSOB akatọọla ozi iti aka n'obi Buhari zigaara ndị Benue Steeti Otu MASSOB akatọọla ozi iti aka n'obi onyeisiala Mohammadu Buhari zigara ndị Benue Steeti maka ogbugbu nke gụnyere ndị isi ha abụọ, kwuo na ọ bụ okwu ịkwa ndị ụka kraịst emu. N'aka nke ọzọ Ohaneze ndị Igbo akatọọla ogbugbu ndị mmadụ ahụ ma kwuo na ọ bụ oke ihe arụ. N'egwuregwu Real Madrid amanyela otu ụkwụ n'ime agba nke ikpeazụ asọmpị Uefa Champịons dịka ha ji ọkpụ abụọ asatara otu merie ndị Bayern Munich Onye oti ọkpọ bụ Deontey Wilder ewepụtala ego dị nde dọla iri ise(50mdolla) iji ma Anthony Joshua aka ọkpọ Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ọrịa kansa abụghị ikpe ọnwụ Onye meriri ọrịa kansa" afirika-45878595,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45878595,Fayose awuchiela ụlọọrụ EFCC,Ọ bụ tata ka njem Fayose gwụrụ dịka aka na-achị Ekiti steetị ka echere onye nọchiri anya ya bu Kayode Fayemi iyi na Ado Ekiti.,"EFCC si na Ayo Fayose ji ha ụgwọ ị zara ọnu. Nke a pụtara na iwu machiri ịnwụchị Fayose maka mpụ na nrụrụ aka ngalaba ụdịri mmehe a dị n'aka ha bụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) boro ya emebiela. Fayose, bụ onye EFCC na-achụ kemgbe tupu ọ lagachite n'okwa gọvanọ, ejirila aka ya ga za oku n'ụlọọrụ EFCC. Cheta na ụnyaahụ Fayose si na ọ ga-ebu ite ya na akwa ndina niile ya gaa zara ọnụ ya taa. Nke a emela ugbua ka Fayose wuchiri ụlọọru EFCC nke oche. Nke mere ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ uwe Fayose yi ga ya bu njem bu nke e dere ""EFCC awụchiela m"". Ọtụtụ mmadụ na Soshal Midia kwadoro ihe Fayose mere, dịka Maazi Joe Abah kwuru na ọ bụ ihe eji ama atụ na o gara n'aka ya: Mana onwere ndị si na ọ bu onye ụka ọchị, dịka onye nwe akara @muuzzy644: Dịka o kwụ ugbua, amabeghi ma EFCC ọ ga-anwụchị Fayose dịka ha mere ụfọdụ ndị ọzọ ha boro mpụ, mana nwa amadị ahu kwadoro akwado." afirika-50720635,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50720635,Maersk MD: Etu onye na-arụrụ ha ọrụ si gbuo nwụnye onyeisi Maersk na Lagos,Onyeisi ụlọọrụ Maersk nọ n'ụlọ ọgwọ alụ ọgụ ọnwụ na ndụ dịka onye na-arụrụ ha ọrụ latrik wakporo ya ma gbuo nwunye ya n'abalị Sọnde.,"Ụlọ ọrụ Maersk so n'ụlọ ọrụ kachasị buo ibu n'ihe banyere njem ngwaahịa n'elu mmiri Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Elkana Bala gwara BBC Igbo na Olamide Goke bụ onye na-arụ ọkụ latrịk kpọrọ enyi ya nwoke bụ Ade Akanbi ka ha ga ohi n'ụlọ Gildas Tohouo. Bala sị na mmadụ abụọ nwetere ohere ịbanye be Maazị Tohouo, bụ onye Kamerun, makana Goke na-arụrụ ya ọrụ ma bụkwara onye ama ama n'ụlọ ahụ. Dịka uweojii siri kwuo, mmadụ abuo gara n'ihu wakpo Tohouo, jiri mma makasị ya na nwụnye ya bụ Bernadette Tohouo ahụ. Ka ihe a na-eme, dịka ndị uweojii siri kwuo, he nwetere ozi ma wụchie ebe ahụ. Bala sị: ""Ndi uweojii nọ n'Ikoyi ruru ma nwụchie ndị kpara mkpa mkpa a n'ebe ahụ."" Akpọrọ di na nwụnye a awakporo gawa ụlọ ọgwụ mana odoziakụ Tohouo anwụọla. ""Maazị Tohouo n'onwe ya ka dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ."" Maazị Bala si na Goko na Akande kwetere na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ. Ọ sị na ha sara ajụjụ ihe mere ha jiri kpaa ike a etu: ""Ọ bụ ohi ka anyị gara."" Bala si na ya nwetere ""ATM"" na akpa ego dị ha zutere n'aka ha."" Ọ sịkwa na Goke sị na on were oge ya sị ka Maazị Tohouo binye ya ego ọ jụ, nke so bụrụ iwe ya o jiri gawa ohi na be ya." afirika-44657922,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44657922,Anwụchiela nwaanyị na-atụ mgbere ụmụagbọghọ,A mara otu nwaanyị onye nọọsụ ikpe na mba Briten maka ịtụ mgbere ụmụagbọghọ.,"Nwannyí amara ikpe maka mgbere agbọghọ A mara Josephine Iyamu ikpe maka ịkpọbụ ụmụagbọghọ Naịjrịa mba Jamịnị ị ga rụọ ọrụ dịka ndị akwụna. N'akụkọ nke pụtara n'ihe ọnyonyo, onye ntaakụkọ BBC bụ Fiona Bruce zutere otu n'ime ndị Iyamụ tụrụ mgbere. Iyamu bụ onye mbụ a ga-ama ikpe site n'iwu a ehiwere ọhụrụ na-etinye anya n'ịtụ mgbere mmadụ. Iyamu si Edo steeti na Naịjirịa ree umụnwaanyị na Jamani, ebe akwanyere na-ire onwe ha. Izupu ụmụnwaanyị n'ala Naijirịa na-eweta nwute nye ndị gọọmentị Naijirịa Nwaanyị a mere ka ndị ṅụọ iyi na ha ga-enye ya ihe niile ha rụtara na-akwụna. Otu nwaanyị ihe a metụtara kwuru na ego oji Iyamu maka orure ya na Jamịnị ruru nde naịra iri na ise. A ga-ekwu ihe a ga-eme Iyamu n'ụbọchị anọ nke ọnwa jụlaị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-46856511,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46856511,Manchester United anyụọla Tottenham nsị n'isi,David de Gea bụ onye na-echere Manchester United bọọlụ ezila na ọ bụ aka gọm n'iche bọọlụ.,"David de Gea mere nke a site n'igbochi bọọlụ ịgafe ya ugboro iri na otu, ọ bụ nke oji ma aka ma ụkwụ mee. Manchester United gosiri Tottenham nkarị n'iji otu ọkpu goolu merie ha n'ime asọmpi agbara n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a n'ụbọchị Sọnde. Marcus Rashford nyere goolu ha ji merie n'ime nkeji iri anọ na anọ site na bọọlụ Paul Pogba gbaara ya. Agbanyeghi nke a, onye kachasị gbapụta ihe n'asọmpi a bụ David de Gea, bụ onye na-echere Manchester United bọọlụ. De Gea mere nke a site n'igbochi bọọlụ ịgafe ya ugboro iri na otu, bụ nke oji ma aka ma ụkwụ ya mee. David de Gea gbawara ndị Tottenham obi site n'igbochi bọọlụ Harry Kane ọtụtụ oge nakwa nke Dele Alli na Alderweired. Nke a mere Manchester United na Arsenal ji nwere otu ọnụọgụgụ na tebụlụ bụ iri anọ na otu ebe Tottenham nọ n'ọnụọgụgụ iri anọ na asatọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51928069,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51928069,Lagos Explosion: Etu mberede Abule Ado siri mee na ihe kpatara ya,A nụrụ ụda dị ka nke nnukwu ogbunigwe na mpaghara Abule Ado dị n'okpuru ọchịchi Amuwo Odofin na Legọs stetti ụbọchi ụka bụ Abalị c15 nke Maachị.,"Agbanyeghị na ndị mmadụ kwenyere na nnukwu ihe gbara ebe ahụ, dịka ụlọ kụrịsiri ha ụdịrị ihe a na-ahụ na mba Syria na-egosi, ajụjụ ndị mmadu kpụ n'ọnụ bụ, ""Ọ gịnị kpatara ihe a?"" Gọọmentị Legọs ehibewere kọmịtị a sị chọpụta nke bụ eziokwu. Aka na-achị Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu ekwela nkwa na ọha ga-amata ihe ha chọpụtara. Ebe a mberede a mere Mpaghara ebe mberede a mere Ebe ihe metụtara sitere ụzọ Adegbola Olujobi ruo ụzọ Otunba Gani Adams n'Abule Ado. Ebe a bukari ebe ndị mmadu bi mana ụlọakwụkwọ umụnwaanyị akpọrọ Bethlehem Girls College bụ ihe sepụtere isi karịa n'ebe ahụ. E nwekara ụlọ ọrụ ndị na-ere gas na-ebe ụzọ Adegbola Olujobi zutere ụzọ Otunba Gani Adams n'Abule Ado. e nwere nnukwu igwe na-ebu mmanụ agbịdị ebe ahụkwa. Gini mere? Ihe anya hụrụ mberede a na-ekwu na ọ bụ n'ụtụtụ, n'etiti elekere asatọ na itoolu n'ụtụtụ Sọnde. Ọtụtụ ndi bi na mpaghara ahụ nọ n'ụlọ ụka dịka ụmụakwụkwọ Bethlehem nọ ebe ha na-ekpe mass na ụlọ ụka dị n'ime ụlọakwụkwọ ha. Otu onye no mgbe ihe mere gwara BBC na ya nọ n'ụzọ ụka oge ọ nụrụ nnukwu isi gas. Ọ sị, ""Asị m ka m ga gwa Fada mana ka m ka na-eru ebe ndị nche na-anọ, gas ekpuchiela ebe niile."" Ọ sị na ya gbara ọsọ gawa ebe ụmụ akwukwọ nọ ga nyee aka kpọpụ ha. Gọvano Sanwo-Olu ejirila nde naira 250 tie ndị ọkụ gaasị metụtara aka n'obi ""Ya bụ ihe adịghị mfe,"" bụ ihe o kwuru, tupu ọ gawa n'ihu ikwu na ya bara ọkada gawa ịgwa Fada. Ọ sị na o ruola nke Fada tupu ọ nụ ọda dị ya ka nnukwu ogbunigwe. Ọ sị, ""Ọ bụ ọkụ si ebe otu onye na-ere nri ka gas ahu sere were daa gbooaa!"" Nwokea ekwughi aha ya si na ya kwnyere na ihe mberede kari ịkarị etu o mere ma ya bụrụ gas ahu gbasara karịa ebe o ruru. Explosion in Lagos: Anụtụbeghi m ụdịrị ụda ahụ mbụ Aka na-achị Amuwo Odofin bụ Valentine Buraimoh gwara BBC okwu n'ebe mberede a mere ka o ka mechara. Ọ sị na ihe a gbara sitere n'igwe bu mmanụ agbịdị. N'ọnụ okwu ya, ọ sị na ọ bụ ihe ọ kpọrọ ""technical issue"" kpatara ya. Gwomgworo tọrọ n'ọwa mmiri Onye ọzọ hụrụ ihe mere kwenyekwere n'ihe onye nke bu kwuru mana o gara n'ihu kwuo na ọ bụ gwomgworo tọrọ n'ime ọwa mmiri na ụzọ Adegbola Olujobi gbawara igwe gas ka ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi pụta. Nkọwa a gbara ihe nkiri dị na soshal midia na-egosi gwomgworo ahu ka o nọ nso ebe gas na-awụfụsị akaebe Ka mberede a mechara Ka abalị abụo gachara, n'etiti ụlọ kwụrịsiri na ndu ndi mmadu furu okpokoro gwomgworo ahụ kpụsa na afụsi anwụru ọkụ, dika ọkụ na anwụrụ ọkụ na afụkasị n'ime okukoro di nso na ya ka. Ndị ọrụ gbata gbata na-akọwa na mmadụ iri abụọ nara mụọ ebe iri abụọ n'ise merụrụ ahụ nọ ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwọ. Ngalaba ""Lagos State Emergency Management Agency"" (LASEMA) na ""National Emergency Management Authority"" (NEMA) ka nọ ebe ahụ arụ ọrụ ha." afirika-43180439,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43180439,"Rivers: Ụkọchukwu egbuola enyi ya nwaanyị,ndị ọzọ",Pastọ Okoroafor Chidebere ebola ekwensu na ọ bụ ya kwanyere ya igbu mmadu atọ.,"Ndị uweojii jidere Pastọ Okoroafor maka ị gbu onye ụka ya ị ji zochie ihe nruruaka ha mere Chidebere kwetara na ya gburu ndị a mgbe ndị uweojii bisara ya nwa aka ị me ka ọ sa asịsa n'isi ụlọ ọrụ ha dị na Mosco Road, Port Harcourt, River Steeti. Ndị gbara ya bụ Pastọ n'anwụ bụ ndị agbataobi onye o gburu nke ọ gwara e be ọ na-ga. Dịka onye osote onyeisi ndị uweojii, Cyril Okoro, siri kwuo mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ, ọ sị na nchọpụta ndị CID mere gosiri na ya bụ nwa amadị na ụmụagbọghọ na-abịa ụka ya n'enwe mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke mere na ọ tụwara otu n'ime ha bụ Uloma Onweagbo ime. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụfọdụ akwụkwọ akụkọ kọrọ na Okoroafor sịrị nwaada ahụ ọ tụwara ime ya tepụ ya mana ọ jụru, nke a mere o jiri memila ya bụ nwaada dị afọ iri abụọ na ise na nzuzo iji zochie arụ ọ kpara. Mana ụfọdụ kọrọ na Uloma na enyi ya nwaanyị bụ Ada Ezeawa gara ịgwa Okoroafor maka ime ahụ ọ tuwara ya. Nke a were Okoroafor iwe mere o jiri rara ha puo ebe zoro ezo ga gbufuo ha abụọ ma nwa Uloma kwọ na azụ. Okoro sịrị na"" nchọpụta gosiri na o jiri akwa kegbu nwa ahụ"". Site n'ajụjụ ọnụ a gbara ndị agbataobi ka e jiri chọta ọzụ Uloma na nwa ya n'ime ọhia dị n' Afam-Igberu Road, dịkwa na Port-Harcourt." afirika-50863728,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50863728,National Assembly: Ụlọomeiwu emechiela ọru afọ 2019,Ndị omeiwu Naịjirịa emechiela ọrụ nke afọ 2019 rue mgbe ha ga-emepe ọzọ n'ụbọchị iri abụọ na asatọọ nke ọnwa Jenụwarị 2020.,"Ụlọomeiwu emechiela ọrụ nke 2019 Ọnyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan ji ohere ahụ kpọpụta aha Smart Adeyemi nke Kogi West dịka onyeisioche na ahụ maka kọmitee njem ụgbọelu. EFCC anwuchiela onyeisi CBN adigboroja Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela otu nwoke ji aha Godwin Emefiele egwu ndị mmadụ chandum. Nwoke ahụ bụ Onyebuchi Nwalozie Julius gbara ama na ya ejile ya bụ ajọ ọrụ gwuo ndị mmadụ ego ruru nde naịra anọ na ụma ise n'Uyo, Akwa Ibom Steeti, tupu aka akpara ya bụ ezekudele. Onyebuchi kwetere na ya ji akara email emefilegodwin586@yahoo.com eme ndị mmadụ anụrụ anya e were ego. O kwuru na ya ji ya bụ ụzọ aghụghọ napụ otu nwaamdị onye mba Arab aha ya bụ Omar Es Sh Deebọkpụrụ ego bụ nke o ji Western Union were zitere ya. O kwetere na ọ bụ ya ji okpueze ịchepụta akara email nke mmadụ agaghị enyo enyo bụ nke ya ji atụ ya bụ akwụkwọ. Ihedioha akpọkuola ibe maka mmepe obodo Dịka ụlọikpe dị elu kpebigoro ikpe maka ntuliala ndị gọvanọ 2019 nke Imo steeti, gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha akpọọla Uche Nwosu ka ọ bịa soro ya na mmepe steeti ahụ. N'ozi odeakwụkwọ ya bụ Chibuike Onyeukwu tinyere aka, Ihedioha rịọrọ ndị niile ya na ha zọrọ ya bụ ọkwa ka kpofuo ihe gara aga bịa tinyere ya aka n'idozi Imo steeti. Trump chọrọ ya ngwa ngwa N'ofesi eh! Dịka ndị ụlọomeiwu nta kpabigoro ikike Donald Trump dịka onyeisiala mba Amerịka, ya bụ onyeisi na-arịọzịka ka ndị omeiwu ukwu bịa mee nke ha ngwa ngwa ka ya mara ebe ya kwu. Ndị kwe ndị ekwe dị n'etiti ndị Demokrat na Rịpọbịkan ekweghị mara mgbe ya bụ ikpe ndị Sịnetị ga-adị. Arteta achirila uwe Arsenal Arteta bụzị onye nchịkọta ndị Arsenal N'egwuregwu, ndi otu egwu bọọlụ Arsenal enweela onye nchịkọta ọzọ. Aha ya bụ Mikel Arteta mana ajụjụ bụ na Mikel, ọ ga-azọ Arsenal?. Cheta na Arteta bụbu osote onye nchịkọta ndị Manchester City ruo mgbe ya na ndị Arsensal tinyere aka n'akwụkwọ. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa Onyeisiala Muhammadu Buhari akasiela ezinaụlọ Benjamin Uwajumogu obi. Uwajumogu bụ onye omeiwu na-anọchị anya Imo North nke lara mmụọ ụbọchị Wenezde. N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu, Buharị kwuru na ọtụtụ ozi iti aka n'obi nke ndị mmadụ na-ezigara ezinaụlọ Uwajumogu gosiri na nwa amadị ahụ fere ala nna ya nke ọma. N'otu aka ahụ kwa, Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu bekwara arịrị maka onwụ Uwajumogu. Ihedioha kwuru na ọnwụ Uwajumogu wutere ya nke ukwu, ma rịọ Chineke ka ọ nabata mkpuruobi ya. Ike Ekweremadu, onye bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu, kwupụtakwara mwute ya maka ọnwụ Uwajumogu. Ekweremadu kọwara Uwajumogu dịka onye omeiwu ma ihe ọ na-eme. Akụkọ kwuru na Uwajumogu gharịpụrụ na mberede n'ime ụlọ ya. Mgbe e buru ya gbaga ụlọọgwụ, ndị dọkịta kwuru na ọ laala mmụo. Ọtụtụ ndị chịburu dịka gọvanọ ka na-aza ụgba Abubakar Malami Ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ bụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka gọọmentị etiti na-enyocha ugbua maka nrụrụaka. Onye kwuru nke a bụ ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami. O kwuru na nke a bụ iji gosipụta na ọchịchị Muhammadu Buhari anaghị ele onye ọbụla anya n'ihu n'okwu gbasara nrụrụaka. Malami kọwakwara na mmadụ dị otu puku na narị isii na iri atọ na isii (1,636) bụ ndị ụlọikpe marala ikpe maka nrụrụaka bido n'afọ 2015 ruo 2019. New Zealand amachiela mmadụ inwe egbe ndị agha Egbe a natara ndị mmadụ na mba New Zealand Bido n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2019, ọ ga-abụ ihe megidere iwu mmadụ inwe egbe yiri ụdị nke ndị agha na mba New Zealand. Mmachi a bụ iji gbochie ụdị ihe mere n'ọnwa Maach oge otu nwoke bu egbe baa n'ụlọụka ndị alakụba gbagbuo mmadụ iri ise na otu. Christchurch: Buo agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa niile- Jacinda Arden Gọọmentị mba ahụ amalitela imebi ọtụtụ egbe bụ nke a nakọtara ndị mmadụ. Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na atụmatụ ahụ adịchaghị mma n'ihi na ọ na-anapụ ndị mmadụ ihe ha ji echekwa onwe ha. Mikel Arteta agaala Arsenal Mikel Arteta A na-atụ anya na ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ga-ahọrọ Mikel Arteta dịka onye nkuzi ha n'ụbọchị Fraịdee. Cheta na Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga tupu ọ laa ezumke nka. Akụkọ ndị ọọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe omimi dị na-iru isi dada" media-45213597,https://www.bbc.com/igbo/media-45213597,#FreeSamuelOgundipe: A tọhapụla onye ntaakụkọ,A tọpụrụ Ogundipe na ụtụtụ taa bụ Fraide dịka ụlọikpe nyere ndị uweojii iwu ka a tọhapụ ya.,"Samuel Ogundipe banyere n'ụlọọrụ Premium Times n'afọ 2009 Ọkaikpe Abdulwahab Mohammed nke ụlọikpe nta dị na Kubwa, Abuja geburu ikpe ahụ n'ụbọchị Wenezde ebe a na-enyeghị ohere ka Ogundipe nwe ọkaiwu nọchitere ya ma nye ndị uweojii ikike ijichi Ogundipe rue ụbọchị Ọgọstụ 20. Mana n'ụlọikpe ụbọchị Fraide, oge e bulitere ikpe ahụ, Ọkaiwu Premium Times rịọrọ ka a tọhapụ ya, Ọkaikpe Mohammed gere ntị ma nye mkpebi ka Ogundipe kwụọ puku 500 ma kpọtakwa onye bi n'Abuja dịka onye ọgbaama (surety). Cheta na ndị uweojii jichiri Ogundipe kemgbe ụbọchị Tuuzde maka ịjụ ikwupụta onye zunyere ya ụka maka akụkọ o dere. Akụkọ ahụ gbara n'anwụ ozi onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris degara onye na-arụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osibanjo nke mere ka a chụọ onyeisi DSS n'ọrụ maka aka o tinyere na mwakpo DSS mere ụlọomeiwu na izuụka gara aga. Ọtụtụ Ndị Naijiria na ndị mbaụwa na-agba mbọ maka ikike dịrị onye katọrọ mwụchị na mkpọchi a kpọchiri Ogundikpe, ebe ụfọdụ mere ngaghariiwe maka ntọpụ ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48773308,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48773308,Enugu Police: Anyị na-enyocha onye otu anyị e chere gburu okoroọbịa n'Oji River,Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ha amalitela inyocha onye otu ha eche na o gburu otu nwaokoroọbịa a kpọrọ Chinonso na Nkwo Inyi dị n'Oji River.,"Akụkọ ndị dị mkpa: Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ebere Amaraizu sị na aka ha akpara onye ọrụ ha ahụ dịka Kọmshịọna enyela iwu ka a malite inyocha etu ihe si mee. Akụkọ kwuru na Nwaokoroọbịa anwụrụ anwụ nwere nghọtaghe dị n'etiti otu nwaọgbọghọ ebe ha na-achọ ịdọrọ ego n'igwe ego ụlọakụ 'First Bank'. Akụkọ kwukwara ịka nke na-eme, onye uweojii bịara were osisi kụọ nwokoroọbịa ahụ n'azụ isi ya, bụ nke butere ọnwụ ya. EFCC egosila akaebe niile ha nwere n'ikpe nrụrụaka Okupe Ụlọọrụ EFCC nọọrọ n'ụbọchị Wenezde abalị iri abụọ na isii gosi ụlọike ihe akaebe niile ha nwere megide Okupe bụbu onye ndụmọdụ onye bụbụ onyeisiala bụ Goodluck Jonathan. EFCC kpọpụrụ Okupe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja maka nrụrụaka ego dị nde narị naịra asaa na ọma abụọ n'ihu ọkaikpe Ijeoma Ojukwu. Ọkaiwu Ibrahim kpọpụtara onye akaebe nke ikpeazụ ya bụ Shuaibu Salisu bụ onye akaebe nke isii n'ikpe Okupe. Enugwu Police: A na-enyocha onye otu anyị e chere gburu nwaokoroọbịa N'ofesi Ndị uweoji anwụchiela otu onye ụlọomeiwu na mba Kenya a kpọrọ Charles Kanyi maka ịkpọ oku ka ndị ojiegoachguego mba ọzọ nọ n'ala ha dịka ndị mba Tanzania, Uganda nakwa ndị China laa. N'egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa awụọla ka awọ wufe n'agba nke iri na isii nke asọmpi Iko mba Afrịca. Ha ji otu ọkpu goolu si n'aka Kenneth Omeruo merie ndị Guinea. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile AFCON: Egypt agbarala Warda ụgbọnwamkpi Otu n'ime ndị mba Ijipt jiri mere isi a hụrụ kwaba okpu n'egwu bọọlụ n'asọmpị AFCON na-aga n'ihu ugbua bụ Amr Warda abụrụla onye a chụrụ ọsọ nwamba na-achụ oke. Otu na-achịkọta bọọlụ mba ahụ gụpụrụ Warda na ndị ga-eso gbaa bọọlụ maka ""ịkpa agwa ekwesịghị."" Onyeisi otu na chịkọta bọọlụ 'Egyptian football federation' sịrị na achụpụrụ Amr Warda iji hụ na ekwere nrubeisi, uchu na itinye uche n'ihe a na-eme."" Onye ntakụkọ BBC Arabic bụ Mohamed Qoutb kwuru na a gbara n'anwụ nkata gara n'etitu Warda na ọtụtụ ụmụnwaanyị na soshal midia ka ijipt na Zimbabwe sọkọtachara mpi. N' Ijipt ka e hiwere asompi iko Afrika (AFCON) a na-ele anya na ha nwere ike ibuli iko ahụ. Ha na mba DR Kongo ga-ezute n'abalị bụ Wenezde na Kairo. Ọ bụ n'ọchịchị GEJ ka m nwetere ikike izu ngwa agha ndịa Mgbọ n'ọtụtụ ngwa ndị agha so n'ihe ejichiri Gọọmenti etiti ekwuola na aka chiburu Ogun steeti bụ Senator Ibikunle Amosun natara ikike n'aka gọọmenti etiti tupu ọ bubata egbe 'AK 47' ruru otu puku ma tinye kwa mgbọ egbe nke ruru Ijeria anọ . Senator Amasun purata kwuo na ọ bụ n'ọchịchi Goodluck Jonathan ka ha nwetere ikike izuta ngwaagha ndia maka ichekwa Ogun Steeti. Umahi: Aka na ụkwụ m adịghị na nkata ịbụ onyeisiala Gọvanọ Dave Umahi ekwuola na obi adighị ya mma dịka otu di icheiche na akawado ka emee yas Onyeisiala nke Naịjirịa. Umahi kwuru na ucheobi ya bu ime ka Ebonyi steeti were dị mma na agba nke abuọ ya dịka aka na achi Ebonyi steeti. O kwukwara na dịka ọ kwadoro ka onye igbo chia na 2023 kama na i ijikọta aha ya na ọchịchị 2023 eruhieru ma buru kwa ihe ihere nye ya. Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ nakwa nke Benue ajụla atụmatụ inye ndị ọchiehi ogige ichi ehi Ndị Fulani na-achị ehi egbuola ihe karịrị mmadụ otu nari n' izu atọ gara aga Gọọmenti etiti akọwala uru iwepụtara ndị ọchịehi nọ na steeti Naịjirịa dị icheiche ogige ebe ha ga na-achị ehi ga-aba n'ikwụsị nsogbu dị n'etiti ndị na-achị ehi nakwa ndị na-akụ ugbo. Mana gọvanọ ise nke ọwụwa anyanwụ nakwa gọvanọ Benue, Taraba na ondo steeti jụrụ ya bụ atụmaatụ, na-ekwusi ike na ha agaghị ekewapụta ala ọbụla maka ndị ọchị ehi. N'egwuregwu, AFCON: Cameroun Vs Guniea Bissau Cameroun achụpụla Guinea-Bissau Otu 'Indomitable Lions' nke Cameroun ewerela ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Guniea Bissau na mmalite njem ha na asọmpi AFCON 2019. Chetakwa na ndị otu Super Eagles ga ezute ndị otu nke Guinea taata na elekere 3:00pm. N'ofesi, 'Yahya Jammeh nke Gambia wakporo m n'ike' Nwata nwanyị meriri na nchọputa nwanyị kachaa maa nma na Gambia apụtala kwuo na Yahya Jammeh achụpụrụ n'okwa dịka onyeisiala Gambia wakporo ya n'ike. Nwaada a kwuru nkea dịka onye akaebe na ngalaba nchọputa na nyọcha ehibere iji lenye anya n'ebubo gbasatara Jammeh na iwakpo umunwanyị n'ike. BBC gbaliri ga ha nụ ihe Mr Jammeh nwere ikwu maka ebubo a mana ọnu na-ekwuchitere otu ndọrọndorọ ọchichị Jammeh kwuru na ebubo ndi a nile bu ezigbote asi. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Slave Trade: Ihe ọkpụ fọrọ maka ịgba ohu n'ala Igbo" afirika-45301757,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45301757,'Restructuring' a ga-aza ekpere Ndigbo n'okwu gbasara oke?,Okwu ihazigharị Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' bụ ude na-ede na Naịjirịa kemgbe oge gara aga kpatara na ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ ịchọ ya bụ ihe.,"Ndịgbo na ndị agbụrụ ọzọ zukọrọ n'Awka ịkpa maka ""restructuring"" Mana kedụ ihe 'Restructuring' pụtara nhazigharị n'asụsụ Igbo a na-ekwu maka ya? Ọkammụta Uche Aja kọwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ iwere ike dị n'etiti nye mpaghara dị ịche iche ka ha nwe ike chịa onwe ha ma nwe ikikere ịhazị mpaghara ha. O kwuru na nke apụtaghị n'obodo ga-ekewa kama na ọ ga-enye ohere mpaghara ọbụla igbo mkpa dịrị ha onwe ha. N'ọnụ ya, ""Nhazi obodo etu a bụ ihe ga-azọpụta Naịjirịa n'ọnọdụ a ọ dị"" Ndị tinyere ọnụ n'okwu a 1. Obi n'achị Ọnịcha Nke mere nso nso a bụ na Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe kwuru na ya bụ nhazigharị obodo dị mkpa. O kwuru na nke a ga-aka baa uru n'ihi na mpaghara niile kwesiri ị nwe ike ị nye onwe ha nrị n'adaberehe n'enyemaka gọọmentị etiti. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a. 2. Ikenga Nnewi Restructuring: Okwu a ka na-agbawoju anya - Ikenga Nnewi Mazi Dozie Ikedife ekwughi ma o kwenyere na ya bụ nhazigharị, mana o kwuru na a ga-agba mbọ kọwaa ya bụ okwu ọfụma tup o kwenye na ya. Gee ihe onyonyo a ka ịhụ ihe o kwuru n'uju. 3. Ohaneze NdịIgbo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Ọ bụghị taa ka ike nọ n'azụ ya bụ na ọ bụghị taa ka otu ohaneze ndị Igbo na-achọ ya bụ nhazi akpọrọ 'Restructuring' N'uche ha, ọ ga-enye ohere ka ndị mmadụ jiri ọnatarachi dị ha n'ime were rụpụta ihe ndị ga-abara ha uru. Ha kwenyekwara na ọ ga-enyeaka belata mmegbu a na-emegbu ndịIgbo na Naịjirịa. Gụọ ihe ha kwuru ebe a Ohaneze asaala Ipob 4. Chukwuemeka Ezeife Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu n'ime ndị kwadoro 'restructuring' Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife sonyere kwado ihazigharị Naijiria na mpaghara. Ezeife sịrị na ọ ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ ma weghachie ya etu ọ dị tupu afọ 1954 oge mpaghara ọbụla na-agbara onwe ha mbọ. 5. Atiku Abubakar Onye ndọrọndọrọ ọchịchị chịburu Naịjirịa dịka osote onyeisiala kwuru na oge eruwo a ga-eji hazị obodo Naịjirịa n'ụzọ mpaghara dị icheiche. O kwuru na ihe nhazi ga-ebute bụ ọchịchị ziri ezi ga-emekwa ka udo dị na Naịjirịa pụta ọfụma maka na ndị mpaghara ọbụla ga-enwe okwu n'ihe gbasara obodo ha. O ji kwa ohere ahụ kwuo na gọọmentị kwesiri ị sepu aka n'ihe gbasara akụnaụba obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51292735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51292735,Coronavirus Outbreak: Onye e che na o bu ya bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie,Nwata akwụkwọ e che na o bu coronavirus si Cahịna bata Ivory Coast mechara ọ bụrụ na o bughi ya.,"Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan Mịnịstry ahụike na mba Ivory kwuru na nwata bụ enyocharala ahụ ma chọpụta na o bughi ọrị a n'ezie. Dịka ọ dị ugbua nwata alakwurula ezinaụlọ ya n'ahụike nakwa izuoke. Nke a na-egosi na ọrịa ọjọọ a marala ụkwụ n'ọtụtụ mbaụwa abatabeghi mba Afrịka chaachaa. Buhari gbaa arụkwaghịm n'ọchịchị - Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye ndu ndị sinetị kachasị nta agwala onyeisiala Buhari ka ọ rịtuo n'ọchịchị ya n'ihe ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. O kwuru nke a na nzukọ ha n'ụbọchị Wednezde mgbe ndị omeiwu na-atụgharị uche n'ọnọdụ nchekwa ma kpọọ oku ka a hazigharịa obodo. Abaribe sị na ihe o ji kpọọ oku a bụ maka na Buhari amala afọ n'ala n'ihe banyere nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ Naịjirịa kamgbe ọ bara n'ọchịchị. Ndị Sịnetọ ndị ọzọ gara n'ihu kwuo ka Buhari chụọ ndị isi ngalaba nchekwa dị iche iche na Naịjirịa. E buliela ego ọnwa ndị NYSC Gọọmentị etiti sị na ha ga-amalite ịkwụ ndị ji otu afọ efe ala nna a kpọrọ NYSC n'ịchafụ ego dị puku naịra isi atọ na atọ dịka ụgwọ ọnwa. Onyeisi ngalaba ahụ bụ Brig. Gen. Shuaibu Ibrahim sị na ụgwọ a ga-amalite na-egbughi oge dịka o si na eko mkpata na mmefu nke afọ 2020. N'ofesi Mba Palestine ajụla atụmatụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara maka ime udo na mpaghara Middle East. Trump sị na Jerusalem ga-abụ isiobodo ndị Izrel ebe ọwụwa-nyanwụ Jerusalem ga-eso bụrụ nke Palestine. Mana onyeisiala Palestine bụ Mahmoud Abbas sị na anaghị ere Jerusalem ere. N'egwuregwu N'egwuregwu Tennis, Dominic Thiem meriri Rafael Nadal ma gbochie ya ịgafe n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi Australian Open na-aga n'ihu ugbua. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Igbo Language: Million, Billion na Trillion bụ gịnị n'Igbo? 'Anyị achọghị Iyaloja na Babaloja n'ahịa anyị' Ndị Igbo na-azụ ahịa n'Odunade na Legọs egosila iwe ha maka atụmatụ Iyaloja na Babaloja a chọrọ ịmalite n'ahịa ahụ. Otu onye na-azụ ahịa n'ebe ahụ bụ Emmanuel gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ ụzọ a chọrọ isi nara ha ụgwọ ụtụisi ugboro abụọ. Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agba mbọ i nweta ndị isi ahịa na ndị okpuruọchịchị ka ha tinye ọnụ n'okwu a. Cheta na otu ihe a mere na ndị na-ere ahịa na 'Computer Village' dịkwa na Legọs. #JusticeforChima Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya #JusticeforChima na-ewu n'elu soshal midia dịka ndị mmadụ ji ohere ahụ a kpọ oku ka-enwetara Chima nwụru n'aka ndị uweojii ikpe ziri ezi Ndị uweojii boro ya na ụmụ nwoke anọ ndị ọzọ ka nọ n'ime mkpọrọ ebubo izu ohi nke ha gbara mbọ gọnarịa. Coronavirus eburula bata 18 Ụlọọrụ ụgboelu British Airways amachiela njem niile na-aga mba Chaịna nakwa ndị si ebe ahụ apụtakwa n'ihi egwu ọrịa Coronoavirus Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ narị anwụọla site n'ọrịa a. Ọ pịa ọkpọ bụ Anthony Joshua a ga-eme ka Mohammed Ali si me? Onye na-ahaziri Joshua ọrụ ekwuola na ọ na-akwado ị lụ ọgụ na mba Kongo dịka Ali si me. Ọ bụ ebe ahụ ka Mohammed Ali nọ kụpụ George Foreman ọkwụrụ n'anya. Akụkọ ụwa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Anambra steeti ga-ebido inye ndị lụrụ agha ọgwụgwọ n'efu Aka na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano enyela iwu na ndị agha niile lụrụ ọgụ n'agha Biafra ga-ebido ị nata ọgwụgwụọ n'efu na steeti ahụ. Ha kwuru na mere nke a iji nyere ndị agha ahụ enyemaka ma cheta kwa agha Biafra biri n'afọ iri ise gara aga. Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba gara n'ihu kọwaa na a ga-ebido ngụkọ na ndenye aha ndị a iji mata ole ha dị. Ịba Lassa ataala is mmadụ 41 kemgbe 2020. N'aka ọzọ Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ site n'ọrịa Iba Lassa eruola iri anọ na otu. Minista ahụike bụ Osagie Ehanire kwukwara na mmadụ narị abụọ na iri ise na asaa bụ ọrịa ahụ na steeti iri na itoolu ugbua n'ala Naịjirịa. Na mba ofesi Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan A na-enyocha mmadụ anọ na mba Itiopia maka egwu na ha bu nje Coronovirus. Gọọmentị mba ahụ agbachiela ndị mmadụ ahụ gụnyere ụmụakwụkwọ atọ n'otu ebe dịka ezigara ọbara ha mba Saụt Afrịka maka nyocha. N'egwuregwu, Ọ ga-akpọtụ na Manchester taa dịka ndị ekwensu ọbara na Manchester ga-achịpụ ya taa n'asọmpị EFL Cup Cheta na otu Man City ji point atọ gafee otu Man United site n'asọmpị ndị ha gbaburu ochie. Gee akụkọ n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-55498056,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55498056,Alor o nwere Igwe abụọ?,Ndọrọndọrọ onye bụ Eze n'obodo Alor dị n'okpuru ọchịchị Idemili Sawụt nke Anambara steeti na-akọtụ n' obodo ahụ ugbua.,"Mmadụ abụọ, MacAnthony Okonkwo na Ebelechukwu Chukwumesili, bụ ndị na-asị na oche Igwe Alor bụ nke ha. Dịka ihe onyonyo o tinyere na sochal midia siri kọwaa, MacAnthony Okonkwo sị na o ya bụ ezigbote Igwe Alor. Okwu a malitere dịka aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano nyere Eze ọdịnala 13 ezumike nwa mgbe nta makana ha soro Maazị Arthur Eze ga-ileta Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja. Igwe Okonkwo sọ n'ime Igwe ndị a. O mechara mee ihe onyonyo ebe ọ rịọrọ Gọvanọ Obiano arịrọ. N'ụbọchị 18 nke ọnwa Ọctoba 2020 akụkọ pụtara na ndị Alor achụọla Igwe Okonkwo ma mee Maazị Chukwuemesili Igwe. Akukọ ahu kwuru na Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige so gaa echichi ọhụrụ a. Gọvanọ Anambara mechara wepụ ezumike nwa mgbe nta ahụ o tinyere ndị Igwe ahụ, gụnyere Okonkwo. Mana,ụfọdụ mmadụ, dịka akụkọ dị n'ụlọ ntaakụkọ Vanguard siri dee, anabataghị atụmatụ ahụ. Mana ka ọ kwụ ugbua, Okonkwo ka na-ekwusi ike na ọ bụ ya bụ Igwe n'Alor. N'ihe onyonyo o mere, o kwukwara na ọ bụ ya bụ otu Igwe e nwere n'Alor ma kwuo na gọọmentị Anambara kwụ ya n'azụ. Dịka ọ kwụ ugbua, ọ na-ada ka e nwere Igwe abụọ n'Alor. Akụkọ ka na-abịa." 50094909,https://www.bbc.com/igbo/50094909,Enugu Airport: 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanu Ibiam mgbe adịghị anya' - Onyeisi na FAAN,Otu n'ime ndị isi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ụgbụọelụ bụ Federal Airports Authority of Nigeria nke akpọrọ FAAN na aha ịchafụ agbarala BBC ama ndị mmụọ.,"Nwaamadị a gbaara anyị ama a na-achọghị ka akpọ aha ya sị na ugbua onyeisiala nyegoro ikike ka ewepụta ijieri naịra iri tinye na ya bụ ọrụ, na oge eruola mgbe ha ga-amalite ya bụ ọrụ n'ikem n'ikem. BBC jụrụ ya ma ya bụ ego onyeisiala Muhammadu Buhari mapụtara ọ ga-ezu ya bụ ọrụ, ọ sara na ọ bụ ego ha tinyere ka onyeisiala nyere ha. Ọ sịkwa na ihe bụ ọkpụrụkpụ ọrụ dị na ya bụ akwụkwọ ha depụtara maka ya bụ ọrụ bụ ihe gbasara irụgharị okporoụzọ ụgbọelụ Akanu Ibiam ya na ọrụ ndị ọzọ na-erijughị afọ. O kwetere na ya bụ ego gọọmenti tinyere aka na ya ga-ezu ya bụ ọrụ. Ya bụ nwaamadị kwuru na obi ụtọ ya bụ na mmiri ozizo akwụsịwala nke bụ na ha nwere ike ịmalite ya bụ ọrụ tupu abali iri agachaa. Ọnwere okwukwe na ha ka ga-arụcha ya bụ ọrụ tupu Ekeresimesi etinye ukwu. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri ihe Coscharis kwuru maka ịmechi bọda Naịjrịa Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka" afirika-43700466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43700466,"Ọkụ latrik, mmanụ agbịdị na ihe ndị ọzọ tinyere ego kemgbe Buhari batara ọchịchị","Mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari ka na-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2015, o nwere ọtụtụ nkwa o kwere n'achụmnta vootu ya.","Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa Ọ kachasị ọtụtụ ihe o kwuru na ọ ga-ebelata ego dị na ya dịka o kwere nkwa ịweta ""mgbanwe"". Mana ugbua, ọ bụghị etu akụ ilu si ada n'ụda ka o si atọ ụtọ, lee ihe ndị tinyesịrị ego kemgbe Buhari batara ọchịchị. Ọkụ Latrik Mgbe onyeisiala Buhari na-achụ nta vootu, o kwere nkwa ọkụ latrik ebighebi mana o nweghị ihe o kwuru maka itinye ego. Ugbua, ngalaba na-elebanye anya n'ọnụ ọkụ latrik bụ NERC etinyela ego n'elu ụgwọ ọkụ latrik bido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2020. E si na Naira 30.23 maka otu kilowatị maka otu awa were pasent otu narị bulie ya rue naira 62.33 maka otu kilowatị. Nke a na-abịa n'agbanyeghị na ha kwere nkwa na ha agaghị eweli ọnụ ya bụ ọkụ n'ezinaụlọ ndị dara ogbenye. Ọnụ mmanụ ụgbọala N'ọnwa Febụwarị afọ 2015 mgbe emere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa, ọnụ mmanụ agbịdị bụ N97 nke emechara butuo rue N87 n'afọ ahụ kwa. Mana ọ gbanweela ụgboro ise kemgbe ahụ, otu mgbe n'afọ 2016, nakwa ugboro atọ n'afọ 2020. O si 87 rue 145 si ya rue 125 si ya rịkwa 143 ma sizie ebe ahụ rue 151 ebe ọ kwụ taa. Nke a na-eme n'ihi ihe Bekee kpọrọ 'Deregulation' emere na mmanụ agbịdị eji arụpụta mmanụ ụgbọala. Gụọ nkọwa anyị mere maka 'Deregulation' n'uju ebe a. Ọnụ nri Ọ bụghị ihe ọhụrụ na ọnụ ego nri na-arị elu kemgbe Buhari banyere ọchịchị. O bu ụzọ rịa elu n'afọ 2016 mgbe akụnaụba Naịjirịa banyere ọtanisi. Mgbe ọzọ nke a mere bụ n'afọ 2019 mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a gbachie oke ala Naịjirịa na Benin Repọblik. O kwuru na nke a bụ iji belata nzubata osikapa mana o mere ka nri ndị ọzọ a na-esi mba Afrịka ndị ọzọ ebubata rịa elu. Nkwa asaa Buhari kwere n'afọ 2015 na ihe o mere Dịka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari zọtara ọkwa ọchịchị na ntụlịka afọ 2019, ajụjụ ọtụtụ dị ndị mmadụ n'ọnụ. Otu n'ime ha bụ o mezuru nkwa ya na otu pati ya bụ APC kwere ndị Naijiria nke ha gbadọrọ ukwu were tunyere ya votu n'afọ 2015? Kedụ ihe o merela ha, iji nata ha nkwado ọzọ na agba nke abụọ? BBC Igbo lenyere anya n'asaa n'ime nkwa o kwere iji tulee ndị o mere na ndị o meghị: I. Ibuso mmerụaka agha Ihe o mere: EFCC napụtara ọtụtụ mmadụ e boro ebubo mmerụaka nnukwu ego na ụlọ mana o nwebeghị onye ụlọikpe mara ikpe maka mmerụka. Onyeisiala na nzukọ ndị isi otu APC mere ụbọchị Monde ebe ọ nọ kwupụta na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019 N'aka nke ọzọ, ndị pati ndị ọzọ na-ebo Buhari ebubo na ọ bụ sọsọ ndị esonyeghị na pati ya ka a na-anwụchi maka mmerụaka. 2. Ibuso Boko Haram agha iji nwe ezi nchekwa Ana chosi Shekau ike na Naịjirịa ugbua. O belatara mkpamkpa Boko Haram ma nata ha obodo ndị ha kpaara dịka nke ha. N'aka nke ọzọ, nchekwa obodo ka na akpụ afọ n'ala n'ihi na ndị Fulani na-achị ehi egbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgbaghara dị na-etiti ha na ndị ọrụugbo. 3. Inye ọrụ dị 720,000 kwa afọ Ihe o mere: Kama inye ọrụ dịka Buhari siri kwe na nkwa ma rotekwara ndị mmadụ oge ọ biara na Legos nsonso, a chụrụ mmadụ ruru nde anọ n'ọrụ. 4. Imachi ndị ọrụ gọọmenti ịga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa Buhari na Trump kpara maka ibuso ndị oyi egwu agha Ihe o mere: Buhari amachighị ya dịka osi kwe na-nkwa, kama, ya onwe, na nwa ya nwoke bụ Yusuf gara mba ofesi maka ịnata ọgwụgwọ. 5. Otu nri n'ụbọchị maka ụmụaka Prịmarị nke gọọmentị Ndị ugwụ Awụsa kachasị nwe ụmụaka anaghị aga akwụkwọ na Naịjirịa Ihe o mere: E bidola atụmatụ a na nanị steeti iri na anọ: Anambara, Enugwu, Oyo, Osun, Ogun, Ebonyi, Zamfara, Delta, Abia, Benue, Plateau, Bauchi, Kadụna na Taraba. Mana ụfọdụ ndị ọrụ obodo kwụụru onwe ha sị na N70.00 maka otu nri anaghị enye nri nwere isi. 6. Ịrụ mahadum nka na ụzụ isii Ihe o mere: A rụbeghị ọbụladi otu. 7. Ime ọkụ latrik ka ọ gbalite rue 20,000 megawat n'afọ anọ Nke a bụ maka iji mee ka ọkụ na-adị mgbe niile. Ihe o mere: Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Babatiunde Fashola siri kwuo, Naijiria enwetarula 7000 megawat. Imo akwodoola maka nyefe ọchịchị Gọọmenti Imo steeti, ekwuola na ha ewepụtala ego a ga-eji mee meme ịnyefe ọchịchị n'aka Ihedioha. Onye enyemaka Gọvanọ Okorocha, Ebere Nzewuji kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka taa. Anyị abata n'Abuja ebe Onyeisiala Muhammadu Buhari gbatikwuru ụbọchị ọrụ ndị Minista ya ruo ụbọchị iri abụọ na asatọọ nke ọnwa Mee a. Ọ gwara ndị Minista ahụ ha were akwụkwọ nyefe ọchịchị ha bịawa ọgbakọ ikpeazụ nke ha ga-eme n'ime ọnwa bụ ebe ha ga-anọ chisa ọwara. Ụlọikpe na London amaala ụmụnwanne atọ ikpe N'ofesi, ụlọikpe na mba UK amaala ụmụnwanne atọ ndị Naịjrịa ikpe maka ịnye aka bufeere ndị otu nzuzo akporo Black Axe ego ruru otu nde pound mba ofesi. Otu n'ime ndị a amara ikpe na-agọ na ọnweghị ihe gbarasa ya na ndị otu nzuzo a, agbanyeghị na nwanne ya nwaanyị na-anụ onyeisi ndị otu a ebe ha bị na London. Onye ntuziaka Chelsea bụ Maurizio Sarri ga-ama ọdịnihu ya nsonso Onye ntuziaka Chelsea bụ Maurizio Sarri N'egwuruegwu, onye ntuziaka Chelsea bụ Maurzio Sarri ga-amata ọdịnịhu ya mgbe otu egwu bọlụ ahụ mgbe ya na ndị isi kpachara ụbụbọ. Maurizio sị na ọ bụ mgbe ha na Arsenal gbachara asọmpị nke ikpeazụ ka ya ga-amata ma ya a ka ga-anọ ka ọ bụ ya uje. Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49098184,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49098184,Buhari's Ministerial list: Ụmụnwanyị asaa nwetara ọkwa minista,Sharon Ikeazor bụ sọọsọ nwaanyị zaraburu ọnụ ya n'ihu ndị ụlọomeeiwu ukwu maka ndị ga-eso bụrụ minista.,"Ụmụnwanyị asaa so na ndị ga-abụ Minster O mere ka ọ fọ naanị ụmụnwanyị asaa n'ime ka Onyeisiala Buhari tinyere na aha ndị ọ họpụtara dịka ndị Minista n'ime mmadụ 43 o zigarala ndị Sineti. Dịka ụfọdụ mmadụ na-eto ụmụnwaanyị ndị a, ụfọdụ na-agbarụ ihu n'ihi na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị sonyere na aha ndị Minista edeputara pere mpe. Nnọchite ụmụnwaanyị n'ọchịchị site na afọ 1919 rue 2019 Site n'ọchịchị Obasanjo rue nke Buhari ndị mmadụ na-ekwu na ụmụnwaanyị enwetabeghị oke kwesịrị ka e nye ha n'ọkwa mịnịsta. Lee ụmụnwannyị aha ha dị na ya bụ akwụkwọ. Sharon Ikeazor - Anambra Sharon Ikeazor Sharon Ikeazor bụ onye onyeisiala Buhari họpụtara dịka ọnyeisi ngalaba ""Pension Transitional Arrangement Directorate"" (PTAD) n'onwa Septemba afọ 2016. Akụkọ na-akowa na Sharon Ikeazor wepụtara atụmatụ nke doziri ọnọdụ PTAD. Ọ bụ onye ọkaiwu nwetere asambodo ya na mahadum nke Benin ma nwete ikike ịka iwu n'aka 'Nigerian Law School' n'afọ 1985. O kwuru n'akara Twitter ya na ihe ga-eme ka Naịjirịa dị mma na-emetụta ya n'obi ma tinye kwa inye ụmụnwaanyị ohere ime nke ọma na ndụ ha. Sadiya Farouq - Zamfara SADIYA FAROUQ Sadiya Farouq bụbụ Kọmishọna gburu gburu Naịjirịa na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ . Ọ nwere asambodo ""Business Administration"" n'aka mahadum nke Ahmadu Bello Zaria, Kaduna Steeti. O nwekwara asambodo osote ọkammụta na ""International Affairs and Diplomacy"" ma tinyekwa nke ""Business Administration"" (MBA) sitere na Mahadum Ahmadu Bello. Amb. Maryam Yalwaji Katagum - Bauchi Maryam Yalwaji Katagum Maryam Yalwaji Katagum na-anọchite anya Naijiria na mba ọzọ ma bụrụ gwa onye na-anọchite anya Naịjịrịa na ngalaba UNESCO site n'afọ 2009. Maryam nwetere asambodo Masters na ""Administration and Planning"" n'aka Mahadum Lagos, asambodo ""Bachelor of Arts"" na Oyibo, Asambodo nkuzi akwụkwọ n'aka Mahadum Ahmadu Bello ma nwee kwaa asambodo ""Social Development Policy, Planning and Practice"" n'aka Mahadum nke London. Gbemi Saraki - Kwara Gbemi Saraki Gbemi Saraki rụbụrụ ọrụ dịka onye omeiwu nọchịtere etiti Kwara ma bụrụ kwa nwanne onye chibụrụ dịka onyeisi ndị omeiwu Naịjịrịa bụ Bukola Saraki. O guru akwụkwọ na Mahadum Sussex nke dị na mba Briten ma nwete kwa asambodo na ""Economics"". Ramatu Tijani - Kogi Ramatu Tijani Ramatu Tijani rụbụrụ ọrụ ka onyeisi ụmụnwaanyị ndị 'All Progressive Congress"" (APC) na Naịjirịa. Dịka ọ gwara ndị ntaakụko The Nation' na ajujụ ọnụ agbara ya n'afọ 2018 , Ramatu nwetere asambodo ""Urban and Regional Planning"" n'afọ 2018 n'aka mahadum Ahmadu Bello nke dị Zaria. O nwekwara asambodo nke mere ya osote ọkammụta na Public Administration. Ramatu kwukwara na ọ na agụ akụkọ ka ọ nweta asambodo ga-eme ya ọkammụta na ""Security and Strategic Studies"". Pauline Tallen - Plateau Pauline Tallen Pauline Tallen rụbụrụ ọrụ dịka osote Govanọ nke Plateau Steeti n'afọ 2007 ma bụrụ kwa nwaanyị nke mbụ rụrụ ọrụ ka osote govanọ na mpaghara ugwu. Na 1999, ka ọ bụ Minista Naijiria gburugburu maka ""science na technology"" n'ọchichị Olusegun Obasanjo. Ọ zọrọ ọchịchị nke Gọvanọ Plateau steeti n'afọ 2011 mana Jonah Jang meriri ya. Lee otu ụmụnwaanyị siri kwụrụ n'ọchịchị site n'afọ 1999 ruo 2019 Ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị Ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị" 42979375,https://www.bbc.com/igbo/42979375,Police Steeti ga-eme ka mmadụ ṅụọ mmirri tọgbọ ikọ,Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo etinyela ọnụ n'okwu ndị kwetara na ọ dị mkpa ịhapụ ndị,"Yemi Osibanjo kwetara na ịhapụ steeti ọbụla ka ha nwee ndị uweojii nke ha bụ ihe ga ebeleta mkpamkpa na akpa na Naịjirịa ugbu a steetị obụla ka ha nwee ndị uwe ojii nke ha. Osiri na ọnụogụ Naịjirịa kariri ndị uweojii enwere ugbua dịka otumba uwa bụ UN sịri tuzie. O kwuru nke a na-ọgbakọ ndị Sineti kpọro maka nchekwa obodo n'Abuja tata bụ Thursday orie. Osote onyeisiala siri na Naịjirịa ebuka ị nọ n'Abuja na ahazi maka nchekwa obodo. O kwukwara na polisi nke steeti na ndị nche ime obodo bụ ihe ga-eme ka udo lọghachịte n'obodo Naịjirịa. Ọ bụ maka mkpamkpa na-akpa na Naịjirịa ugbua mere e ji kpọ ọgbakọ a. Yemi Osinbanjo Sikwara na gọmentị kwesiri itinyekwu ego n'ego a na-amaputa maka nchekwa obodo. Ọ dọkwara aka na nti ka ""aghara ị gbakwụghe ihe gbasara okwukwe uka na nke agburu ebe mmadụ si na-okwu a na-ese"". Ọ sịkwara na Naịjirịa na ndị agbataobi ya kwesiri ị gbakọaka gbochie ndi amakaekwu ji mkpụmkpụ egbe agafe obodo ndị a." afirika-44472677,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44472677,Ginị mere nwamba na-ebute egwu n'ime ọtụtụ mmadụ?,Nwamba maọbụ 'buusu' bụ anụmanụ na-ebute nnukwu egwu n'obi ọtụtụ mmadụ n'ala Naịjiria.,"N'ala Bekee nwamba bụ anụmanụ a na-ahụ n'anya ọfụma ọfụma Ọ kachasị njọ n'ala Igbo, maka na ọ bụrụ na ị gbaa ọtụtụ ndị Igbo ajụjụ gbasara nwamba, ha ga-agwa gị na nwamba bụ ajọ anụmanụ. Anyị jụrụ ndị mmadụ dị iche iche ihe mere ha ahụghị nwamba n'anya ncha ncha, aziza ọtụtụ ha tụrụ anyị n'anya. N'echiche ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ: Nwamba bụ amusu! Nnamdi Nwosu kwukwara na ọ bụ nwamba jiri ojii bụ nke bụ amusu. N'ọnụ okwu ya ''Nwamba bụ anụmanụ na-eme juu, na kwa na-aga kwa nwanyọọ, ihe a bụ ihe na-ebute egwu n'obi'm"". Egbuola ọtụtụ nwamba maka ebubo na a bụ amusu Anya nwamba na-atụkwa ndị ọzọ egwu Patrick Adigwe gwara anyị na mkpụrụanya nwamba bụ ihe na-atụ ya egwu. ""Anya a na-eke dịka ọkụ n'abalị, kedụ ụdị anụmanụ bụ nke ahụ?"" Nwamba na agwọ bụ anụmannụ abụọ na-ebute egwu Nwamba nwere nsi Otu nwoke aha ya bụ Peter Obiejesi kwuru na n'uche ya nwamba nwere nsi n'eze ya nakwa na mbọ ya, nke mere o ji atụ ya egwu. Mana otu nwoke aha ya bụ Chika Jones bụ onye hụrụ nwamba n'anya kwuru na ihe a niile ndị mmadụ na-ekwu esighị n'aka nwamba. Chika Jones na nwamba ya Jones kwuru na ""Nwamba bụ anụmanụ na-apụta n'abalị ịchọta ihe ọ ga-eri. Ihe a mere ka ndị mmadụ kwubiri na ọ bụ amusu. N'echiche ha, ihe ọbụla na-aga n'abalị bụ amusu."" Jones kwukwara na ihe a mere ka ndị mmadụ na-eji ụdị anya a nke a na-elekwa agwọ, maka na agwọ na-aga n'abalị. Gịnị ka omenala Igbo kwuru maka nwamba? Chigozie Nnabuihe bụ onye okammụta n'omenala Igbo kwuru na Igbo enweghi iwu ọbụla kpebiri na nwamba bụ anụmanụ ọjọọ maọbụ amusu. Nnabuihe kwukwara na o nwere ndị na-eri nwamba n'ala Igbo. Patrick Adigwe kwetara n'okwu a makana o kwuru na o nwere ndị obodo n'Ibusa n'ime Delta steeti na-eri nwamba. Emume nwamba puruiche bu ihe na-ebute ụfọdụ egu Ebee ka egwu nwamba sịrị bịa? Ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ n'akụkọ a kwuru na ọ dị ọrụ ikwu ebe egwu nwamba sịrị bịa. Nnamdi Nwosu kwuru na ọ dị ka na ihe nkiri na-apụta na Nollywood tinyere aka n'ibute nnukwu egwu gbasara nwamba. Peter Obiejesi kwekwara n'ihe Nwosu kwuru. O kwuru na ""ọtụtụ ihe nkiri na Nollywood na-egosi ndị amusu na-aghọ nwamba. Ihe a sokwa na-ebute egwu"" Ebubo amusu Chika Jones kwuru na o nweela ndị kpọrọ ya amusu maka na ya nwere nwamba n'ụlọ. Jones kwuru na ""Echiche m bụ na ndị a kwuru ihe a na-egwuso m egwu mana o nweela ọtutụ mmadụ kwuru na ha agaghị abịa be m maka na enwere m nwamba. Ọ bụghịkwa egwuregwu o."" O kwuru na ya nwere olileanya na ndị mmadụ ga-akwụsị igbu nwamba n'ihi na ụwa na-asala anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48410342,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48410342,Barcelona vs Valencia: Valencia emee Barcelona ụra aga n'anya,"Ọ dị ka ajụ Liverpool gbanyere Barcelona n'asọmpi Champions League ka na-ebu ha, ka Valencia meriri ha ma bulie iko Copa Del Rey.","Messi ebee ọzọ N'agbanyeghị na Barcelona ji bọọlụ ọtụtụ mgbe, Valencia bu ụzọ nye goolu oge Kevin Gameiro gbakara neetị na nkeji iri abụọ na otu (21). Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Rodrigo atụkwasị ọzọ na nkeji iri atọ na atọ (33) iji mezuo ya abụọ, n'ime ọkara nke mbụ. Valencia jidere onye egwu ndị Barcelona bụ Lionel Messi kechie ya ụkwụ na aka n'ọkara nke mbụ, nke bụ na ọ hụghị ụzọ mee ihe e ji mara ya. Mana nke ahụ egbochighi ya ịgbara Barcelona aka ahịa na nkeji iri asaa na abụọ (72). Nke a bụ nke mbụ Valencia na enye Barcelona goolu abụ n'ọkara mbụ kemgbe 1952 ha gbawara bọọlụ. Asọmpi a bere na Barcelona 1 - 2 Velecia. Akụkọ ga-amasị gị" mba-uba-43225680,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43225680,Achụọla ndị ọrụ BBC isii,Ngalaba BBC na-ahụ maka nlekọta ndị mmadụ sị na ha achụọla mmadụ isii maka ilele ihe nkiri akwamiko na kọmputa ọrụ ha.,"BBC Media Action na-agbanwe ndụ ndị mmadụ n'akụkụ ụwa niile site n'ihe nkiri Ngalaba ahụ akpọrọ 'BBC Media Action' sị n'ihe nrụrụaka a mere n'ime afọ iri gara aga, sịkwa na ndị achụrụ n'ọrụ bụ ndị mba ofesi. Ngalaba a dị na mba ofesi anatala nde Euro iri na asaa n'afọ ise gara aga n'aka ngalaba akpọrọ 'UK's Department for International Development' (DFID). Ngalaba DFID sị na ha enweghị akụkọ ọjọọ gbasara akparamagwa akwamiko. Ihe a mere na-abịa n'oge a na-enyocha ndị na-elekọta mmadụ na mba ofesi maka akparamagwa akwamiko nke ndị ọrụ Oxfam n'obodo Haiti. DFID agwala ngalaba niile na-elekọta mmadụ na mba ofesi ka ha wepụta nkwado gbasara nlekọta na iwu ga-emegide akparamagwa ọjọọ ndị a. BBC Media Action sị na ha asaghachịla, sị na ha ewepụtala nkwado ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43450020,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43450020,ICSC chọrọ ịkpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe maka 'ajọ ọchịchị',Otu jikọtara ndị gbanụ gbanụ n'ala Igbo bụ Igbo civil society coalition agwala gọọmentị na-achị ugbua na ha anaghị erubeisi n'usoro ọchịchị nke a kpọrọ 'True Ferderalism'.,"Ndị Coalition of Igbo Civil Societies sị na oge eruola mgbe Igbo ga-achịkọ ọnụ Onyeisioche ndi otu a bụ Maazi Bismark Oji, kwara arịrị na President Muhammadu Buhari ka na-agakwa n'ihu na-akpachapụ Ndigbo n'ike ọkwa ọbụla na gọọmentị ya. Ọ sị n'agbanyeghị na agwara ya ka ọ gbanwee, ihe na-ebe ka na-ebekwa. Onye ji ọkwa ""national coordinator"" otu a bụ Ọkammuta Obasi Igwe kwuru na oge eruola mgbe Ndigbo ga-ejikọ aka onụ napụta oke ruru ha. Ndi otu a katọrọ ogbugbu ndị na-achị ehi na-egbu ndị mmadụ n'ala anyị, ma gwa gọọmentị na oge eruola ijide ndị niile na-akpa ike ọjọọ a, ma taa ha ahụhụ dịka iwu obodo sịrị kwuo. Ndị bịara na ya bụ nzụkọ otu Igbo Civil Society Coalition (ICSC) bụ ndị isi otu ndị ọzọ na-ahụ maka ọnọdụ Ndigbo na Naịjirịa. Bismark Oji kwuru na ndị otu ha niile amalitela izisa ozi n'ala Igbo niile ka ndị mmadụ gaa nweta akwụkwọ ntuliaka bụ PVC maka ntuliaka nke na-abịa n'ọnwa ole na ole. Ozi ha wepụtara na-ekwukwa na ha adịla njikere ịgba gọọmentị Buhari na otu ọchịchị APC akwụkwọ maka ụdịrị ntaramahụhụ ụmụ Naịjirịa nọ n'ime, ogbugbu ndị na-achị ehi na egbu ndị mmadụ, nakwa mmegbu ha na-emegbu Ndigbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49283851,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49283851,Army and Police: 'Ebee ka Hamisu Bala Wadume nọ?'- Ndị uweojii ajụọla ndị agha,Okwu gbasara ogbugbu ndị agha Naijria gburu ndị uweojii atọ na Taraba steeti aghọọla okwu nwunye di na ibe ya dịka ndị uweojii na-ajụ ndị agha sị ha kọwaa ebe Alhaji Hamisu Bala Wadume nọ.,"Wadume bụ onye ndị uweojii na-ebo ebubo na ọ bụ onye ntọ a ma ama na-akpa ike na Taraba steeti nke ndị uweojii nwụchiri, mana ndị agha gbagburu ndị uweojii atọ ma tọghapụ ya n'okporoụzọ Ibi-Jalingo dị na Taraba Steeti. Ndi uweojii ahụ e durala mmụọ bụ Usman Danzumi, Mark Ediale nakwa Dahiru Musa. N'ozi nke dị uweojii wepụtara n'akara Facebook ha na mgbede Tọzde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ọnụ na-ekwuru ha bụ Frank Mba kwuru na ozi ndị agha Naijiria wepụtara gbasara mgbagbu ha gbagburu ndị uweojii atọ akwụghị ọtọ. Col Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ndịagha kwuburu na ndịagha gbagburu ndị uweojii ahụ na amaghị ama dịka ha nwetara ozi na ndị ntọ kpụ ndị mmadụ na-agafe. Mana Mba sara sị, ""Alhaji Hamisu Bala Wadume bụ onye ntọ nwere nnukwu ego nke ndị uweojii nwụchiri mana ndị agha were ya dịka onye a tọọrọ ma 'gbapụta ya."" ""Ugbua, kedụ ebe ọ nọ? Kedụ ebe onye ahụ ha gbapụtara nọ?"" Ajụjụ ndị ọzọ ndị uweojii na-ajụ bụ : "" Kedụ ka onye ntọ e ji ịga jichie gbalahụrụ ndị agha bịara gbapụta ya."" "" Ọ bụrụ na Alhaji Hamisu Bala Wadume bụ onye a tọọrọ atọrọ n'ezie, ndị agha gbapụta ya, gịnị mere na a kpụgaghị ya isi ụlọọrụ ndị aha iji dee ozi ihe mere ma gbaa ya ajụjụ dịka omenala ndị agha dị."" ""Kedụ ihe mere na ndịagha gbara ha egbe na nsonso n'agbanyeghị na ha kọwara ha onwe ha dịka ihe onyonyo na-efegharị ugbu a na-egosi?"" N'ozi Mba wepụtaburu, o kwuru na ndịagha a gbagburu ndị uweojii ahụ na-agbanyeghị na ha ma na ha bụ ndị uweojii. Ka ọ dị ugbua, a ka na-eme nyocha maka ihe a mere. Lee akwụkwọ ndị uweojii deputara si na ndịagha gburu ndị uweojii atọ ma tụghapụ onye ntọ ama ama ha jidere." afirika-44625567,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44625567,"DSS ahapụla Abaribe, ọ ga-alaghachị ọrụ taa",Ọ bụ n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Uche Awom ka ọ sị zie ozi a.,"Ndị DSS agwaghị ya ihe ha jiri jide ya maọbụ ihe ha ji hapụ ya Ọ gwara BBC na ọ bụ ebe elekere isii n'ọma nke mgbede ka Abaribe nwereonwe ya n'aka ndị DSS jichiri ya kemgbe ụbọchị ise"". E nyere Abaribe ihe a kpọrọ 'administrative bail' na Bekee ma nyekwa ya n'aka ndị ọkaikpe na-anọchị anya ya, onye ndu ha bụ okaikpe ukwu Chukwuma-Machukwu Ume. Ụfọdụ ndị mmadụ na-aṅụrị maka mwereonwe Abaribe ma na-egosi ya na soshal midia. End of Twitter post, 1 A nwụchịrị Abaribe n'ehihie ụbọchị Juunu 22 n'ekwughị ihe mere e jiri nwụchịe ya ma gakwa n'ụlọ ya ịme nyocha. Anụkwara kepu kepu na ụfọdụ ndị so Abaribe gbochiri ndị DSS ịkpụrụ ya pụọ mgbe onye ọkaikpe ukwu nyechara ịkpe ya ụnyaahụ. O ji akwụkwọ a kpọrọ ""Dirty politics"" wee gaa ụlọikpe ụnyaahụ Awom gwara BBC na ihe ndị so ya na-achọ bụ ịmaata ihe o mere e jiri nwụchie ya ma nyekwa ohere ịkwuchite ọnụ ya. Ọ sị na ndị DSS jụrụ ịnye ya bụ ohere ma zakwa ajụjụ ihe ha jiri nwuchie ya, ha mechara si n'azụ ụlọ zupu ya n'ụlọikpe ahụ. Mana ụlọikpe tinyere ụbọchị 14 ọnwa Nọvemba maka ikpe Nnamdi Kanu. BBC Igbo ka na-agba mbọ ị nụ olu ndị DSS n'ihe gbasara okwu a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46425992,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46425992,2019 Election: Ndị nwere nkwarụ ga-esonye na ntuliaka - INEC,Onyeisioche INEC Enugwu bụ Emeka Ononammadu ekwuola na INEC adịla njikere ihu na onye ọbụla nwere nkwarụ bụ onye nwere akwụkwọ ikike eji atụ vootu were ike soro mee ntuliaka 2019.,"Emeka Ononamadu bụ onyeisioche Inec Enugwu steeti Ononamadụ kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere nkparịta ụka ụbọchị Monde, Disemba atọ, 2018. Ọ sị na ọrụ mbụ dị ha n'aka iji mejuputa nkwa a bụ ịme ọnụ ọgụ ndị niile nwere nkwarụ na Enugwu steeti, mata ebe ha bị, ụdị nkwarụ ha nwere na ihe ha maa gbasara ntuliaka a na-abịa. O kwukwara na nke a ""ga-enyere ha aka ịmata udi ihe ndị dị otu a chọrọ iji nyere ha aka mejuputa ebum n'obi ha maka atụm vootu 2019"" Maka ndị nwere nkwarụ n'aka Ononamadu sị na INEC nyere ohere ịhapụ onye nwere nkwarụ aka ka ọkpọrọ onye ọtụkwasara obi iji nyere ya aka mee mbinye aka ahụ. ""Onye ndụ ahụ agaghị abụ onye amanyere amanye. Ọ ga-abụ onye ike dị n'obi ahụ họpụtara,"" dịka Ononamadu sịri kwuo. Ọ sị na INEC na ọgbakọ ndị nwere nkwarụ ka na-enwe nzukọ iji mata ụzọ dị iche iche aga esị nyere ha aka. Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka Ndị kpuruisi Ononamadụ sị na INEC ewepụtala akwụkwọ ikike nke ga nyere ndị kpuruisi aka ịme ntuliaka. Ọnyeisioche a sị na INEC dị njikere ịnye ndị ike ndị n'obi ọzụzụ nke ga-eme ka ha nwee ike mee ya bụ ntuliaka. Ọ sị na ""ndị a nwere ọzụzụ ga-enyere ndị otu ha na-enweteghị ọzụzụ a aka."" INEC Enugwu na-akwado ọgbakọ pụrụiche iji gee ndị nwere nkwarụ dị iche iche ntị ka ha kwuo ụzọ ha che aga esi nyere ha aka n'atụm vootu 2019. Ọgbakọ a ga-akpọtụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Desemba n'Enugwu. Ọ sị n'ọgbakọ a ga-eme ka ọnụ rụọ ndị ike dị n'obi n'okwu. Ọnụ okwu ndị ike dị n'obi N'aka ọzọ, David Obinna Anyaele bụ onyeisi ndị Centre for Citizens with Disability (CCWD) kwuru na agbanyeghị nkata ha ndị INEC kpara ihu na ndị nwere nkwarụ so mee ntuliaka, mana "" ihe ha na ahụ anaghị eju ha afọ? David sị n'uche ya ""ọdịghịm ka ndị INEC ana agba mbọ ihu na ndị ike dị n'obi sọ mee ntuliaka 2019."" Ọmaraatụ na ihe mere na ntuliaka Osun steeti gosiri na ndị INEC ebughị ndị nwere nkwarụ na Naịjirịa n'obi, agbanyeghị ihe a kwere na-nkwa. Ọ sịkwa na-agbanyeghị, na ndị ụlọọrụ ha bụ CCWD sọkwa INEC agbambọ ihụ na-emere ọnụọgụ isi ndị nwere nkwarụ na ụfọdụ steeti nke Enugwu so n'ime ha ka ha wee maka mkpa ha nwere bụ nke pụrụ igbochi ha ịtụ vootu. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri David Anyaele na-akpọku na ndị Igbo maka mbinye aka 2019" 46336634,https://www.bbc.com/igbo/46336634,Ikeogu Oke: Etu ndị na-ede mbem si echeta ya ugbua,BBC Igbo chọpụtara na Ikeogu Oke dị afọ iri ise na otu nwuru n'ụbọchị 24 Nọvemba n'Abuja ebe ọ na-anata ọgwụ maka ọrịa kansa Ayịnya (Pancreatic cancer).,"Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke Cheta na Oke bụkwa onye turu ugo ndị ụlọọrụ Nigeria Liquified Natural Gas mụpụtara dịka onye kachasị ede mbem nke afọ 2017. Ndị ihe ọ na-ede na-amasị apụtala na soshal media na-eto ndụ ọma o biri. ‏@martin_ijir n'elu akara ya na Twitter dere na mbem na-eto nnukwu mmadụ Oke bụrụ End of Twitter post, 1 @chikaunigwe dere na Oke nwere obi ọma. ‏@jekwuozoemene chetara onyeọbụla na Igbo nwere nkwenye na mmadụ anaghị anwụ anwụ na ọ bụ njem ka onye ahụ na-aga. ‏@BuraBariNwilo dere na ọgaghị echefu ihe ọma niile Oke dere. Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ ""Nigerian Prize of Literature"" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ ""The Heresiad"". Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem. Akụkọ ga-amasị:" afirika-43535888,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43535888,Dapchi anabatala ụmụakwụkwọ Boko Haram tọọrọ mbụ,Ụmụakwụkwọ Dapchi ruru otu narị na ise ndị Boko Haram tọghapụ n'izuuka a alaghachiala Dapchi.,Ha ji otu ọnwa nọrọ n'aka ndị Boko Haram Nne na nna ha na ndị obodo Dapchi putara n'ịrọ ịnabata ha. Onye ntaakụkọ BBC Chris Ewokor kwuru na aṅụrị juru ebe niile mgbe a hụrụ ndị ụmụakwụkwọ a. Mana egwu ka dịkwa makana ndị Boko Haram dọ ndị ụmụakwụkwọ a aka na ntị sị ha alaghachịla ụlọakwụkwọ ọzọ. Nke a na-ebute nnukwu egwu n'obodo ahụ. Ihe ọzọ na-abute egwu bụ otu nwaakwụkọ n'ime ha bụ Leah Sharibu ka nọ n'aka ndị Boko Haram. Ndị Boko Haram ka ji Sharibu makana o kwuru na naghị agọ okwukwe ya n'ime Christ. Udo ọbịala Dapchi? Cheta na akụkọ pụtara ụbọchị ole na ole kwru na ebe niile dara jụụ n'obodo Dapchi maka egwu na-atụ ndị mmadụ maka na ha nwetara ozi na ndị Boko Haram na-abịa obodo ha. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-44187682,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44187682,Naịjirịa nọ n'ọnọdụ ọgbaghara - Onaiyekan,"Maka oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa ụgbụa, Archbishop na-ahụ maka ngalaba Katọlik dị na Abuja bụ Cardinal John Onaiyekan ekwuola na obodo a nọ n'ọgbaghara.","Popu Benedict nke iri na isii bụ onye họpụtara Onaiyekan dika Cardinal n'ọnwa 2012 Onaiyekan kwuru na oke ogbugbu a adịghị mma n'ihu Chukwu nakwa n'oge eruola mgbe ndị isi ọchịchị ga-eji kwusi ya kpam kpam. Mgbe ọ na-aka ụka akwamozu maka mmadụ iri na itoolu gunyere ndị fada abụọ ndị ana-enyo na ọ bụ ndị ọchịehi gburu n'ọnwa Epreelu, ọ rịo ka ndị Naịjirịa leghara ebum no obi ha dị iche iche ma zọpụta Naịjiria n'ibanye nnukwu ọgbaghara. Onaiyekan kọwara ọnwụ ndị a dika ihe dị egwu ma na-ayọ ka a ghara ihụta ya dika ihe eji eme ndọrọndọrọ ọchịchị. N'ọnụ ya, ''Obodo anyị nọ ọnọdụ ọgbaghara.'' '' Anyi ga-abanye nnukwu nsogbu maọbụrụ na anyị chọọ mmekọta maọbụ nkewa tụmadị dika agbụrụ anyị dị iche iche.'' Onaiyekan kpọkuru gọọmentị etiti ka ha mee ihe puru iche ga-akwụsị oke ogbugbu ndị a ma yọkwa ndị mmadụ ka ha saa anya ma chekwa nwanne ha. Ndị ụka katọlik pụtara n'igwe maka akwamozu a na ngagharịiwe N'otu ọgbakọ ahụ kwa,osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo yọrọ ka Chukwu kasie ma chekwa ndị Benue steeti. Osinbajo kwuru na ndị na-egbu mmadụ na Benue steeti anaghị atụ egwu Chukwu maọbụ mmadụ. Gọvanọ steeti ahụ bụ Samuel Ortom kwuru na ọ ụgboro atọ a na-eli ndị mmadụ nwụrụ nụ n'uju na steeti ahụ kamgbe mbido arọ 2018. Ndị ụkọchukwu pụtakwara maka ya bụ emume Ortom kwuru na ka ọdị ụgbua ,ụmụaka ruru puku 80 anaghị aga ụlọakwụkwọ na Benue steeti maka nsogbu na ogbugbu ndị ọchịehi na-eme. Cheta na ndị ụka Katọlik niile nọ na Naịjiria mere ngaghariwe ụnyahụ maka ya bụ oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa. Akukọ ndi ga-amasi gi:" egwuregwu-44071460,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44071460,Gịnị ka Yaya Toure ga-eme ugbua ọ chọrọ ịhapụ Man City?,Yaya Toure kwuru na ọ ga-akwụsị ịgbara ndị otu Manchester City bọọlụ na ngwụcha afọ a.,"Yaya Toure nwetara ihe nrite 'ọkacha agba nke Afrịka' nke ndị BBC nyere ya n'afọ 2013 na 2015 N'agbanyeghị na ndị Man City buliri iko Premier League nke afọ a, Toure agaghị eso ha asọmpi ndị ọzọ na-abịa dịka nke a kpọrọ community shield. Toure dị afọ iri atọ na ise (35) gbaara Man City bọọlụ afọ asaa (2010-2018) ebe o so ha bulie iko asaa gụnyere nke Premier League atọ, tupu o kwuo na ọ ga-ahapụ ha pụọ. Ọ gbakwaara ndị Otu Barcelona afọ atọ (2007-2010), ebe o so ha bulie iko asaa gụnyere otu nke Champions League. Ikele ndị mmadụ maka ịkwado ya, Toure dere na Twitter sị: Etu ndị otu ya ji sị ya 'ka e mesịa ' Ya na nwanne ya nwoke bụ Kolo Toure gbaara ndị obodo ha bụ Ivory Coast bọọlụ. Maka ịma nka ya ọfụma, Yaya nwetara ihe nrite 'ọkacha agba nke Afrịka' ugboro anọ nọkọtara ọnụ; n'afọ 2011, 2012, 2013, 2014. O nwetakwara ihe nrite nke 'ọkacha agba na Manchester City' nke afọ 2013/2014. Ndị otu ya na Man City kwuputakwara ihe ha ga-eji cheta ya n'otu ha. Kedụ ihe ọ ga-eme ugbua? Oge Yaya na-agba bọọlụ, ya na nwanne ya Kolo nwere egwu e ji mara ha abụọ nke a kpọrọ ""yaya and Kolo song"". Ha na-agba ya ọkachasị ha abụọ zukọọ ọnụ. N'egwu ahụ, ha abụọ ga na-agụ ""Yaya, Yaya, Yaya"" ""Kolo, Kolo, Kolo"". Otu onye na-agba n'eweli aka elu, onye nke ọzọ na-agba na-ehulata ala. Egwu ha mere ọfụma nke mere ka ndị mmadụ na-agba n'England oge ha na-ewu. Yaya na Kolo Toure gbatara ọnụ ha na nnukwu otu abụọ dị na England, ya bụ Manchester City na Arsenal N'agbanyeghị na ọ dị afọ iri atọ na asaa (37) diọkpara nne Yaya bụ Kolo bidoro ịrụ ọrụ dịka onye nchịkọta a kpọrọ 'technical assistant' n'otu Celtic n'afọ 2017. Ọ kwụsị ịgba bọọlụ, Yaya nwere ike iso ụzọụkwụ Kolo tinye isi n'ọrụ nchịkọta. Na ọ dị afọ 35 abụghị ihe nwere ike ịkwụsị ya ịgba bọọlụ ma ọ chọọ. Ọtụtụ ndị Afrịka kwụsịrị ịgbara ndị nnukwu otu bọọlụ na-agafe otu ndị anaghị anụcha aha ha ọfụma inyere ha aka ime ka a nụ aha ha, ma sikwa ebe ahụ kpata ego ha ji ala ezumiike nka. Yaya kwuru na ọ gaghị akwụsị ịgba bọọlụ nwere ike gaa mba China maọbụ Amerịka maọbụ Quatar gaa bidokwa ịgba bọọlụ ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46419967,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46419967,"Jubril: Anwụghị m anwụ, a ka kwụm chịm - Buhari",Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadụ Buhari azarala ọnụ ya n'ebubo Nnamdi Kanu boro ya na ọ nwụọla kamgbe afọ 2017.,"Onyeisiala Muhammadu Buhari ji aha pati APC azọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 Buhari katọọrọ ebubo a site n'okwu o kwuru mgbe ya na ndị Naịjirịa bi na obodo Krakow nke mba Poland na-akparị ụka. Onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmad depụtara nke n'akara twitter ya; Buhari kwuru ""Ọtụtụ ndị chere na m nwụrụ n'oge m na-arịa ọrịa. Ihe a bụ mụ n'ezie."" ""Aga m eme emume ncheta afọ iri asaa na isii nke ọ mụmụ m. M ka ga-adị ike."" End of Twitter post, 1 N'aka nke ọzọ onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na onweghi mgbe ọ sịrị na a kpụrụ Buharị akpụ. O kwuru na ọ bụ onye ọzọ a kpọrọ 'Jubrin' si na Sudan na-anọchi anya ya n'ọkwa dịka onyeisiala. Kanu kwuru nke a na mgbasaozi ya n'igwe Radio Biafra ụnyaahụ n'iji zaghachị okwu Lai Mohammed kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46580074,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46580074,Boko Haram ga-agwụ site n'amara Chineke - Buhari,Onyeisiala Buhari akpọọla ndị ndu mpaghara Chad Basin oku ọzọ pụrụiche maka okwu nchekwa na mpaghara ahụ.,"Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang. N'ime ọgbakọ nke ha nwere taa n'Abuja, Buhari kwuru na oge eruola mgbe ndị ọjọọ bụ Boko Haram ga-akwara ngwo ngwo ha pụọ. N'okwu ya ""Nke a bụ agha a ga-alụcha, anyị ga-enwe mmeri site n'amara Chineke, n'ikpochapụ ihe iyi ndụ egwu na mpaghara a. ""Ndị ndu ibe m, cheta nụ n'ọgbakọ anyị na N'Djamena, inwogharị usoro anyị ji ebu agha a bụ isiokwu anyị. ""Mkparịtaụka anyị taa bụ maka inyocha ozi ndị kọmittee anyị hiwere wepụtara na ụzọ anyị ga-eji aga n'ihu"". Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang. Cheta na ha nwere ọgbakọ yiri nke a n'isi mba Chad bụ N'Djamena n'ọnwa Nọvemba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47282590,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47282590,Custom Officer: Etu i kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe,Onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Kelechi Eze akpoola oku ka a kpubụ onye ọrụ Kọstom gbagburu mmadụ n'ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya.,"Ọnụ na-ekwuru ndị Kọstọm bụ Joseph Atta kwuru na ọ bụ ndị njem bu ngwaahịa iwu mabidoro banyere onye ọrụ ha ọgụ nke mere na mgbọ dị n'egbe o bu gbapụrụ tụọ onye nọrọ onwe ya. Eze kwuru na onye mere ihe ọjọọ kwesịrị ka a kpụrụ ya gaa kpe ya ikpe na ọ bụghị igbagbu ya dịka onye ọrụ Kọstọm mere. Ihe onyonyo fegharịrị na mbido izuụka a gosiri ebe otu onye ọrụ Kọstọm gbagburu otu nwoke a kpọrọ, Godwin Onajaro, n'okporoụzọ awara awara si Shagamu gawa Benin. Ngwa ngwa akụkọ ahụ pụtara, ọnụ na-ekwuru ndị Kọstọm bụ Joseph Atta gọpụrụ onye ọrụ ha. Atta kwuru na ọ bụ ndị njem bu ngwaahịa iwu mabidoro banyere onye ọrụ ha ọgụ nke mere na mgbọ dị n'egbe o bu gbapụrụ tụọ onye nọrọ onwe ya. Mana ụlọọrụ ụgbọala ahụ bu ndị njem bụ Iyare Motors gwara BBC na ọ bụ ụgha na ha bu ngwaahịa iwu mabidoro. Onye ọrụ ụlọọrụ ụgbọala ahụ kpọrọ onwe ya Solomon kwuru na ""onye ọrụ kọstọm gbara egbe ahụ ṅụrụ mmanya."" Ọ kọwara na ọ bụ okwu ego mere ka ọ gbaa egbe ahụ. 'Onye ọrụ kọstọm gbagburu mmadụ kwesịrị ị ga mkpọrọ' Na nkọwa ya, Eze, onye na-arụ n'ụlọọrụ nchekwa ọ chọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na onye Kọstom kwesịrị ịga nga n'ihi na agwa ọ kpara megidere iwu. O kwuru na ọ kara anwụchị onye na-ada iwu karịa ịgbabu ya. Ụmụ Naijiria ndị ọzọ etinyela ọnụ n'okwu ahụ. Ha na-ebo ndị Kọstọm ebubo ị nọchị ikpemkwụmọtụ sịte na ịzọtara onye otu ha. Ihe i kwesiri imee ma izute onye ọrụ nchekwa Eze nyere ọha mmadụ ndụmọdụ atọ etu ha kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe. Lee ha: 1. Kwanyere onye ọrụ nchekwa ugwu 2. Ha kwa gị mee ihe, mee ya 3. Ọ bụrụ na i nweghị akwụkwọ, soro ha gaa ụlọrụ ha, i rue ebe ahụ irue ebe ahụ ịgwọ ụgwọ dịka iwu siri kwuo." afirika-52068466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52068466,Coronavirus: Ihe ga-akpọwanye nkụ n'izu na-abịa,Ndị ọkammụta agbaala afa na ọ bụ ezie na obodo bụ igwe otu izu akpọchichere ebe niile maka ọrịa coronavirus mana ihe ka ga-akawanye njọ n'izu na-abịa.,"Ọkanchọcha azụmahịa, Kachi Ononuju kwuru na nke a ka bụ ụtụtụ na-ebe ihe isiike dị. Ọ gwara ndị mmadụ kee aji n'ume na nke ukwu ka kpe azụ. Kachi sị na ọ bụrụ na aga emela coronavirus na Naịjirịa, na ihe ka mma bụ ikpọchi ebe niile ruo ihe dịka izuụka abụọ. O kwuru na nke ahụ pụtara na ihe ga-esiwanye ike, mana nke ka njọ ga-eme ma ọbụrụ na-emeghị otu ahụ. Ọtụtụ mmadụ amalitelarị iti mkpụ maka ọnụahịa nri n'ahịa n'otu izuụka akpochiri ebe niile na Naịjirịa maka ọrịa coronavirus. Nke a mere BBC Igbo ji lebe anya ịchọpụta ka ahịa nri si tinyecha ego na steeti ụfọdụ n'Alaigbo nakwa na Legọs. Abakaliki N'Abakaliki, Ebonyi steeti, ihe anyị chọpụtara na ihe nri e si ebe ọzọ bubata na steeti ahụ tinyechara ego mana ihe nri ana emepụta na ebe ahụ dị otu ọ dị. Dịka Ngozi Nwobia bụ onye gara ahịa taa bụ Fraịde si kwuo, ihe dịka mkpuru azụọkpọọ tinyere ego site na narị naịra abụọ na iri ise (N250) ruo na narị naịra atọ na iri ise (N350). Nke pụtara na ọ tụkwasara otu narị naịra n'elu ọnụahịa ya. Otu mkpuru azụ a bụzị N350 na Abakaliki ugbua Ọ kwuru na Ịsha ana ere otu narị naịra (N100) bụzị narị naịra ise (N500) ugbua. Tomatosu mkpụrụ na onwe ya sizi narị naịra atọ (N300 ) ruo narị naịra ise (N500). Enugwu Nwaada Tonyi Jimoh bụ onye na-ere ahịa n'Enugwu sị na ọtụtụ ihe nri tinyere ego. Akpa osikapa Bekee si puku narị naịra iri abụọ na otu (N21,000.00) ruo puku narị naịra iri abụọ na ise. Nkata tomatosu mkpọ sị na puku naịra ise (N5000) ruo puku naịra asaa na nari ise (N7500). Katọnụ Spageti si puku atọ na narị asaa na iri ise (N3750) ruo puku atọ na narị asatọ na iri ise (N3850). Otu tin garị si narị anọ (N400) ruo narị asaa (N700). Otu akpa Semo si puku atọ na narị isii (N3600) ruo puku atọ na narị asatọ (N3800). Legọs Nwaagboghọ na-esi nri ahịa na Legọs bụ Agatha John-Pat sị na ụfọdụ ihe nri rikwara na legọs ebe ndị ụfọdụ nọkwa ebe ha nọbụ. Penta egwusi sị otu puku naịra na narị asaa (N1700) ruo otu puku na narị asatọ (N1800). Penta garị sizi narị naịra asaa (N700) ruo narị naịra itoolu (N900). Akpa Semo obere ka nọ ebe ọ nọ na otu puku naịra na ụma asaa (N1700). Yabasị na onwe ya ka nọkwa na narị naịra abụọ (N200) mana ha kpopuru ya ihe na mkpụrụ ole ọ na-adịbu. Akụkọ ga-amasị gị Uru na ọghọm dị na mmadụ isi n'ụlọ arụ ọrụ" afirika-54352095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54352095,US Presidential Debate 2020: Ihe mere na nrụrịtaụka Donald Trump na Joe Biden,"Dịka Donald Trump na Joe Biden na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka mere nrụrịtaụka maka ntuliaka a ga-eme n'ọnwa Nọvemba, lee ihe ndị ị kwesịrị ịma.","Trump na-azọ ọkwa a n'okpuru pati Republicans ebe Biden na-azọ n'okpuru Democrats, nke a bụ mbụ ha abụọ na-ezute na nrụrịtaụka. Chris Wallace bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Fox News chịkọtara emume a e mere n'abalị Wenezde, Septemba 30. N'etiti Trump na Biden, isiookwu a kacha rụtụ aka bụ Covid-19, akụnaụba obodo, ihe gbasara agbụrụ, mpụ nakwa ihe gbasara ugwu ntuliaka. Ha dụkwara onwe ha aka n'ọnụ banyere ezinaụlọ ha, dịka Trump dụkwara Wallace chịkọtara ya aka n'ọnụ. Wallace gwara Onyeisiala Trump ka ọ kwụsị imebi iwu e tinyere maka ya bụ nrụrịtaụka. Wallace ji ihe gbasara onye ga-anọchi Ọkaikpe Ruth Bader Ginsburg nwụrụ anwụ dịka Ọkaikpe kachasị n'ụlọikpe etiti bido ya bụ nrụrịtaụka. Gbasara ahụike Biden kwuru na ndị mmadụ ekwesịghị ịtụnyere Trump n'ihi na ọ na-agbasi mbọ ike ịhụ na ọ wepụrụ enyemaka gọọmentị na-enyere ndị mmadụ ịkwụ ụgwọ ahụike. Ọ katọkwuru etu Trump si ebuso mkpa mkpa Covid-19 agha na mba Amerịka, ebe Trump turu ọnụ na akụnaụba obodo na-etolite kemgbe ọ banyere ọchịchị ma kwe nkwa na ọ ka ga-eto na-aga n'agbanyeghi na Covid-19 metụtatụrụ ya. Gbasara Akụnaụba obodo Wallace kwuru na n'ime afọ atọ mbụ Obama na Biden chịrị, na mba Amerịka kewapụtara ọrụ karịa ole Trump kewapụtarala n'ime afọ atọ mbụ ọ chịrịla. Trump tinyere ọnụ sị ya ""Ọ bụ ntolite kacha akpụ akpụ kemgbe afụ 1929"". Biden kwuru na ezigbote ahụ adịghị akụnaụba mba Amerịka mgbe ha banyere ọchịchị n'afọ 2009, mana ha kwalitere ya nke ọma tupu ha apụọ. Biden katọrọ Trump n'ihe gbasara akụnaụba obodo, dịka o boro ya ebubo itikpọ akụnaụba Barack Obama hapụrụ mgbe ọ chịchara. Trump na onwe ya kwuru sị na ihe ọ ma bụ na o weghachịtara ọrụ ruru 700,000. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na Biden merie, na akụnaụba mba Amerịka ga-akpụ afọ n'ala. Gbasara ụtụisi Wallace jụrụ Trump: ""Ọ bụ eziokwu na ị kwụrụ narị dọla asaa na iri ise ($750) n'ime otu afọ dịka ụtụisi a na-akwụ gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?"" Trump sara ya sị ""A kwụrụ m nde kwuru nde dọla, a kwụrụ m nde dọla iri atọ na asatọ ($38m) n'otu afọ, kwụọ nde dọla iri abụọ na asaa ($27m) n'otu afọ."" Biden gwara Trump ya gosi ndị mmadụ etu o si akwụ ụgwọ ụtụisi ya, ebe Trump sara Biden sị ""Ị ga-ahụ ya mgbe ọ gwụrụ"" - n'ihi na a na-enyocha ya. Mana iwu ekwughi na ọ gaghị egosiputanwu ya ugbua. Wallace jụkwara ya ọzọ sị ""Ị ga-agwa anyị ego ole ị kwụrụ n'ụtụisi gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?"", nke Trump sara sị ""nde kwuru nde dọla, ị ga-emecha hụ ya."" Ọ gara n'ihu gwa Biden na ọ bụ iwu ụtụisi ha tinyere oge ọchịchị ha mere ka ndị dị ka ya na-erite ụdịrị uru a. Ebe Biden sara ya sị na ụtụisi Trump tinyere dabaara naanị ọgaranya, na ọ ga-ewepụ ha ma ọ bụrụ na o merie, ma tinye ya n'inyere ndị chọrọ enyemaka aka. Mara na ndị osote ha bụ Mike Pence nke Trump na Kamala Harris nke Biden, ga-eme nrụrịtaụka nke ha n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba." afirika-54791074,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54791074,Cyprian Ekwensi: Dike si n'ọkwa 'Director' malite ire komkom rọba n'ihi ịhụnanya Biafra,"Aha Cyprian Ekwensi bụ aha na-ada ụda, ọbụghị sọ na Naịjirịa nakwa Afrịka, kama n'ụwa niile.","Ekwensi bụ onye isiojii mbụ nwetara ọkwa 'director' na mịnịstrị mgbasaozi na Nịjirịa, mana ọ hapụrụ ọrụ ahụ sonyere Biafra Ihe e jikarị mara Ekwensi bụ ide akwụkwọ, mana ọrụ ọ rụrụ oge a lụrụ agha Naịjirịa na Biafra sokwa n'ihe e ji mara ya. Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Cyprian Ekwensi: Cyprian Ekwensị bụ onye nkuzi, onye nlekọta ọhịa (forester), onye mmepụta ọgwụ (pharmacist), onye mgbasa ozi (broadcaster) nakwa onye mmepụta ejije (film maker) Cyprian Ekwensi na agha Biafra Cyprian Ekwensi bụ onyeisi mgbasa ozi mba Biafra n'oge ahụ Oge ọgụ Biafra malitere, Ekwensi hapụrụ nnukwu ọkwa o ji na ngalaba mgbasaozi nke gọọmentị Naịjirịa, wee sonyere Biafra. E nyere ya ọkwa onyeisi mgbasaozi nke Biafra n'oge ahụ. Lee onyonyo gosiri nke a dị ka ụlọọrụ ntaakụkọ 'Africa Press' si wepụta: Oge agha kwụsịrị, Ekwensi malitere ire komkom rọba iji chụta ihe ọ na-eri, n'ihi na ọrụ ya na ngalaba mgbasaozi Naịjirịa alaala. Lee ihe o kwuru oge otu onye ntaakụkọ n'oge ahụ gbara ya ajụjụ ọnụ maka ya: Akwụkwọ Cyprian Ekwensi degara Ekwensi dere ọtụtụ akwụkwọ a nụrụ aha ha anụ n'ụwa niile. Akwụkwọ mbụ o dere bụ n'afọ 1947, mana tupu ọ nwụọ, o bipụtara akwụkwọ karịrị iri anọ (40). Malite n'afọ 1960 Naịjirịa nwetara nnwereonwe ya, Ekwensi na-ede opekatampe otu akwụkwọ kwa afọ. Akwụkwọ ya bụ 'Jagua Nana' bụ nke a ga-asị kacha wuo ewuo. Lee ụfọdụ akwụkwọ ndị o bipụtara: Cyprian Ekwensi ji akwụkwọ ya bụ Jagua Nana wee rite nturuugo pụrụ iche a kpọrọ 'Dag Hammarskjöld International Prize in Literature', n'afọ 1968. Ka afọ ya gbagotewere, Ekwensi sonyekwara ụlọọrụ ntaakụkọ 'Drum Magazine' dịka onye odee nke bekee kpọrọ 'columnist'. Na 2001, Naịjirịa nyekwara ya nkwanye ugwu dịka 'Member of the Federal Republic' (MFR) Nwa Cyprain Ekwensi bụ George Ekwensi bụ onyeisi otu 'Cyprain Ekwensi Foundation' Nwa ya nwoke bụ George Ekwensi kwuru na nna ya abaghị oke ọgaranya. Ọ bụ nwa ya nwoke a na-elekọta otu a kpọrọ 'Cyprain Ekwensi Foundation'. Ọrụ ha bụ ime ka agụmakwụkwọ na-abawanye na Naịjirịa, nakwa inyere ndị nwunye ndị ọrụ nchekwa di ha nwụrụ anwụ aka. Cyprian Ekwensi na Chimamanda Adichie Chimamanda Adichie, ada Igbo e ji ide akwụkwọ mara, kwuru na Cyprian Ekwensi Ndụ Ekwensi metụrụ ndụ ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa. Otu onye n'ime ha bụ Chimamanda Adichie, onye kwuru na Cyprain Ekwensi bụ onye kachasị metụta ndụ ya nakwa ọrụ ya dịka ode akwụkwọ. Na mkparịtaụka o nwere ọtụtụ afọ gara aga, Chimamanda kwuru na ọbụ Ekwensi ka ọ na-elegara anya oge ọ na-eto eto. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Uche Azikiwe: 'Etu Nnamdi Azikiwe si lụọ m'" media-45213596,https://www.bbc.com/igbo/media-45213596,Inec: Anambra gaanụ nata akwụkwọ ntuliaka ụnụ,Ọtụtụ akwụkwọ ntuliaka ka ka nkụ n'Anambra - INEC,"Onyeisiụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Anambara steeti bụ Nkwachukwu Orji ekwuola na akwụkwọ ibinye aka ruru otu narị iri atọ n'anọ bu akwụkwọ mbinye aka dị n'ụlọọrụ ha ugbua. O kwuru na INEC ga-arịọ ndị isi obodo dị iche iche na steeti ahụ ka ha were akwụkwọ ntuliaka ndị na anaghị anata yabụ kaad were nye ha. Nnochirionye Afunanya bụ onye na-ekwuchiri ndị DDS ọnụ Ndị ọrụ nchekwa obodo na nzizo akpọrọ Department of state services emeela otu nwafọ Igbo aha ya bụ Nnochirionye Afunanya dịka ọnụ na-ekwuchiri ụlọọrụ ha. Cheta n'ime afọ atọ oge onyechiburu ụlọọrụ ahụ bụ Lawal Daura, DSS eweghị ọnụnaekwuchitere ha. Aretha Franklin anwụọla Na mba ofesi, nwanyị oluọma nke ama ama bụ Aretha Franklin a nwụọla na mba Amerika. Ọ bụ oti ọrịa Kanca gburu Franklin dị afọ iri asatọ n'isi. Spain akpapụla Naịjiria N'eguwregwu, Spain akpapula otu Falconets n'asọmpị iko mbaụwa nke ndị ụmụnwaanyị nọ n'okpuru afọ iri abụọ. Spain meriri Nigeria ọkpụ abụọ asatara otu. Gee akụkọ anyị nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu" afirika-44023443,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44023443,Arsene Wenger efeela aka ikpeazụ dịka onye nchịkọta Arsenal taa,Arsene Wenger nwetara ekele pụrụiche ka ndị Arsenal na ndị nkwado ha sịrị ya 'daalụ maka ọlụ ọma' ọ lụụrụ ha n'ime afọ 22 ọ chịkọtara ha.,"Arsene Wenger chịkọtara Arsenal afọ iri abụọ na abụọ Ka ha na ndị otu Burnley zukọchara n'asọmpi Premier League, ha kelere Wenger maka na ọ bụ egwuregwu ikpeazụ nke Arsenal ga-agba na be ha bụ Emirates n'afọ a tupu ọ pụọ. Wenger dị afọ iri isii na asatọ (68) nabatara ekele ha ma kwuo na obi dị ya ụtọ na ha hapụrụ ya ka ọ chịkọta ha afọ ole ahụ. O kwuru ""Daalụ nụ maka ikwe ka mụ na unu nọrọ ruo ugbu a, mana nke kachasị nke, a dị m ka unu - a na m akwado Arsenal."" ""A ga m na-akwado Arsenal ruo echi. Ọ bụ ihe jikọtara anyị n'ime mkpụrụndụ nke ahụ anyị, ebumnobi nakwa nchegbu ndị ahụ."" Ọ gara n'ihu kwuo ""Ọ ga-amasị m ikele onye ọbụla nọ n'otu a na-eso eme ka otu a bụrụ ọpụrụiche."" Ndị Arsenal kwadoro ọfụma ịsị Arsene Wenger 'ka emesịa' ""Ndị otu egwuregwu na-agba ugbua nwere ahụmara pụrụiche, ma n'ọgbọ egwuregwu ma n'ezi. Kwado ha n'afọ na-abịa maka na ọ kwesịirị ha."" ""Owu unu ga-ama m. Daalụ nụ maka isonye n'ihe dị ezigbo mkpa na ndụ m. Ọ bụ olileanya m na m ga-ahụ unu mgbe na-adịghị anya."" Arsene Wenger ekwubeghị ma ọ na-ala ezumiike nka ka ọ ga-achịkọta otu ọzọ Ndị Arsenal nyere Wenger iko ha nwetara n'afọ 2003/2004 oge ha gbachara otu afọ bọọlụ a na-emerighị ha, ka ọ bụrụ ihe ọ ga-eji na-echeta oge ọ chịkọtara ha. Tupu ọ pụọ n'ọgbọ egwuregwu, otu nwatakịrị nna ya ku n'olu ya weliri akwụkwọ iji rịọ Wenger akwa eriri olu ya (tie), nke mere ka Wenger yipu ya ma nyekwa nwata ahụ. Ndị ọzọ na-ahapụ Arsenal Ọ bụghị naanị Wenger na-apụ n'Arsenal n'afọ a. Ndị na-akwado Arsenal kelere Arsene Wenger maka afọ iri abụọ na abụọ ọ chịkọtara ha Arsenal nọ n'ọkwa isii na tebulu premier league nke afọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48916058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48916058,Nigerian Customs sị na onye otu ha bịara ụlọọrụ ha n'Abuja ejichaghi uche aka,Joseph Attah bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ibubata ngwaahịa na Naịjirịa bụ Customs ekwuola uche ya na onye otu ha bịara njem n'ụlọọrụ ha taa ejighi uche ha.,"Onyeisi Custom bu Hameed Ali Ọ sị na ọ bụ ezioukwu na onye ọrụ ahụ ndị mmadụ tinyere foto ya na soshal midia yi ọkwa akpọrọ ""Deputy Comptroller General"" na Bekee wee bata n'ụlụọrụ Customs n'Abuja. ""Ọ bụ eziokwu na ọ bịara, mana ọ bụghị eziokwu na ọ bịara n'ụlọọrụ onyeisi anyị. ""Ka ndị mmadụ hụrụ ya, hụrụ ọkwa o yi n'uwe ya, a gbara ya ajụjụ ọnụ, ma chọpụta, site n'etu o si asa na o jighi onwe ya aka."" Attah sị na ha kpọrọ dọkịnta mgbe a hụrụ n'ihe a abụghị nke ha e meeli. Ọ sị na onye a nwere ọkwa ""Assitant Superintendant"" aha ya bụ Dahiru nọ n'ụlọọgwu ugbua."" Ọtụtụ okwu a na-ekwu maka nwa amadị a abụghị eziokwu. ""Ndị mmadụ na soshal midia amachaghi ihe mere. Ha na-ekwu ihe ọbụla ha chọrọ. Onye nke a kwuo nke ya, onye ọzọ e kwuo nke ya.""" afirika-49625079,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49625079,World Suicide Prevention Day: Ka ndi Igbo sị ahụta onye ọbụla wepụrụ ndụ ya,Etu ndị mmadụ si ewere ndụ ha ugbua na Naịjirịa na-agbazi anya mmiri.,"Ọ na dịzị ka chị bọọ a nụ ọzọ. Ngalaba na-ahụ maka ahụike a kpọrọ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ihe karịrị mmadụ puku narị asatọ na-ewere ndụ kwa afọ ọbụla. Na Naịjirịa, ọ dịkwazị ka ọdachị a na-ewuru ndị ntorọbịa tụmaadị na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Naani na Mahadum nke Naịjiria dị na Nsukka ka enweterela akụkọ ndị ntọrọbia atọ chọrọ iwepụ ndụ ha. Mmadụ abụọ gara n'ihụ mee ya ebe a zọpụtara otu onye mgbe ọ na-achọ ime ya. Soshal Midia a na-enyere ndị mmadụ aka iwere ndụ ha? Ihe ọzọ na-agba anya mmiri bụ na ụfọdụ ndị a wepụrụ ndụ ha ji soshal midia kwupute etu ha ga-esi mee ya. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuola na mgbawa obi, ahụhụ ụwa, ụbịam, esemokwu ezinaụlọ, mwakpo, nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike ibute nkopu ụbụrụ nke na-akpata mmadụ iwere ndụ ya. Mana kedụ ka ndị Igbo sị ahụ ọdachị a? Onye na-ahụ maka ihe gbasara omenaala Igbo bụ Olueze Ụkaejuoha kọwara na mmadụ igbu onwe ya n'ala Igbo bụ arụ ka arụ. O kwukwara na etu o si di njọ bụ na a na-eburu ozu onye ahụ ga tunye n'ajọ ọhia. Onye ahụ lọ ụwa ọzọ, a ga-akpọta dibia siri ike ga-agwọ nnukwu ọgwụ iji mee ka onye ahụ ghara iwere ndụ ya ọzọ. Etu a ga-esi gbochie ọdachị a Ukaejuoha kwuru na ọ bụrụ na akụziere ndị ntorobia Igbo omenala ọfụma, na ha agaghị na-eche maka iwere ndụ ha ma ihe isiike bịa. Mcginger Ibeneme bụ dịbia ahụike kwukwara na ikwụsị atụmatụ ọjọ a ga-ahịa ahụ makana ụwa anaghị akwado ị dị mma echi. O kwuru na ọ ga-aga ka mma ịma ọkwa ka ndị mmadụ mara ebe na ebe ha ga-emenwu mkpesa gbasara echiche iwere ndụ ha. ""Ọ dịkwa mkpa ikpesa onye ịchọpụtara na-akpa agwa ka onye chọrọ iwere ndụ ya n'aka ndị ọ bụ ọrụ ha inyere udiri ndị a aka. Ihe nkiri a ga-amasị gị: South Afrịka Killings: ""M na di m na ụmụ atọ anyị na-agbalaga"" Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48949444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48949444,Super Eagles Squad: Ị ma ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles niile?,Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles na-eme ụmụ Naijiria niile obioma n'asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a.,"John Mikel Nchekwube Obi bụ onye ndị otu Super Eagles. Otu egwu bọọlụ Trabzonspor nke dị na mba Turkey bụ ebe ọ nọzi ugbua. Ọ bụ onye Anambra Steeti. Ha agafeela na agba abụọ nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi ebe ha ga-ezute mba Ivory Coast maọbụ Algeria ụbọchị ụka, abali iri na anọ nke ọnwa Julaị. Ị ma mmadụ ole so n'otu ndị Super Eagles? Ị ma aha ha na ebe ha na-agba bọọlụ? Lee ya ebe a: Ahmed Musa bụ nwa afọ Naijiria mbu nyere goolu abụọ na asọmpi iko mba ụwa. Ọ bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Al-Nassr nke Saudi Arabia. Ighalo bụ mba China ka ọ nọ ugbua akpata ihe ọ na-eri. Ọ na-agbara ndị otu egwu bọọlụ Shanghai Greenland Shenhua. Ọ bụ onye Edo Steeti William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti. Balogun bụ onye Naijiria bụrụkwa onye Germany. Nna ya bụ onye Ijebu-Ode na Ogun steeti. Ọ na-agbara Brighton and Hoves Albion nke mba England. Kenneth Omeruo bụ onye otu Chelsea nke England mana ọgbabeghi bọọlụ ebe ahụ ma otu. Chelsea na-ezipugharị ya na-enya otu egwu bọọlụ dị iche iche. Ọ bụ onye Abia. Oghenekaro Etebo na-agbaburu Warri Wolves nke Delta Steeti. Ebe ọ nọ ugbua bụ Stoke City nke mba England. Ọ bụ onye Delta steeti. Alex Iwobi na-agbara Arsenal nke England bọọlụ. Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Jay Jay Okocha na Nne Iwobi bụ otu nne ji ha. Nna ya bụ onye Anambra ebe nne ya bụ onye Delta steeti. Wilfred Ndidi bụ ịgba etiti (midfield) ka e ji mara ya. Ọ na-agbara otu Leicester City nke England. A mụrụ ya na Legos steetiu. Nna ya bụ onye agha. Ugochukwu John Ogu sonyere ndị otu Super Eagles n'afọ 2013. N'ọnwa Mee afọ a ka ọ hapụrụ otu Hapoel Be'er Sheva nke mba Israel. Amabeghi ebe ọ ga-aga ọzọ. Chidozie Awaziem bụ onye Enugwu steeti. O na-agbara ndị FC Porto nke Portugal, mana e zipuru ya gaa Çaykur Rizespor. Abdullahi Shehu bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Bursaspor nke mba Turkey. Ọ gbaburu Kano Pillars Daniel Akpeyi bụ ochee goolu. Ọ bụ ndị Kaizer Chiefs nke South Afrịka ka ọ na-echere. Ọ bụ onye Nnewi na Anambra Steeti. Samuel Kalu dị afọ 21. Ọ na-agbara Bourdeaux nke France. Ọ bụ onye Abia steeti. Temitayo Olufisayo Olaoluwa (Ola Aina) na-agbara ndị Torino nke mba Italy bọọlụ. Ọ gbaarala ndị mba England n'ogogo 'Under 16, 17, 18, 19 na 20' Jamilu Collins bụ onye Kaduna steeti. A mụrụ ya na 1994. Otu egwu bọọlụ ọ nọ na ya bụ SC Paderborn 07 nke Germany. Moses Simon na-agba bọọlụ na Levante nke Spain. A mụrụ ya na Jos Naijiria n'afọ 1995 Henry Onyekuru bụ onye Anambra. Ọ na-agbara ndị Galatasaray nke mba Turkey, mana ndị nwe ya bụ ndị Everton nke England. Paul Onuachu na-agbara FC Midtjylland nke Denmark. A mụrụ ya n'afọ 1994 n'Owere dị n'Imo State Samuel Chukwueze bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua. Nwata nwoke a na-agbara ndị Villareal nke Spain. Ọ bụ onye Umuahia dị n'Abia steeti. Ọ gbara naanị afọ iri abụọ. Francis Uzoho na Ikechukwu Ezenwa bụ ndị ochee bọọlụ Naijiria. Uzoho bụ onye Imo steeti nọ mba Spain, ebe Ezenwa na-echere ndị Katsina United. Victor Osimhen bụ onye Edo State. Ọ na-agbara ndị Sporting Charleroi nke mba Belgium. Ọ dị afọ iri abụọ. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-49124335,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49124335,Ndi Igbo na-azụ ahịa na Ghana: Mkpagbu a na-akpagbu anyị akarịala,Ụmụ Naijiria na-azụ ahịa na mba Gana akpokuola gọọmentị etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ha na-ekwu na mmiri agafeela garị n'okwu mkpagbu ha na-agabiga na mba Gana.,"Ahịa dị n'Akra,Gana Nke a na-eme dịka otu jikọrọ ndị ahịa Gana a kpọrọ 'Union of Traders Association' (GUTA) ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe ga-akpụ ọkụ n'ọnụ megide gọọmenti ha ma ọ bụrụ na ha etinyeghị n'ọrụ, iwu mmachi ndị mbịara mbịara na-azụ ahịa mgbere. Onyeisi otu ahụ bụ Joseph Obeng kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọbụla ọnwa atọ zuo, ""ndị otu anyị ga-awuju ezi ime ngagharịiwe. Otu n'ime ọdụahịa ha gbachiri na Kumasi "" Ọchịchị obodo abụghị okwu nwanne na nwanne, ka asị na Gana na Naijiria bụ nwanne, i nwezie iwu, ị gaghị etinye ya n'ọrụ."" Na nkọwa ya otu onye n'ime ndị ndu otu jikọrọ ndị Naijiria na-azụ ahịa na Gana a kpọrọ 'Nigerian Union of Traders Associations', (NUTA) bụ Kizito Obiora kwuru na Ọ bụ ezie na ndị Gụta majara na-aga eme ngagharịwe. 'Mkpagbu ndị Gana na-akpagbu anyị o nweghị onye na-ebe ya ndị Ghana na Naijiria' Ebe niile bidoro kpọwa ghara ghara kemgbe Monde ka a ga-asi na ọgbaghara achọrọ ịda n'etiti ndị ahịa Gana na ndị nke Naijiria n'Ahịa Opera Square dị n' Akra, Gana. Obiora gwara BBC Igbo na 'ha kpọchiri ọdọahịa ụmụ Naijiria ụbọchị Monde mana gọọmenti ha na ndị uweojii mere a gbapekwa ya ụnyahụ (Wenezde)."" Prof Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ ""Gọọmenti ha gwara anyị na ha ga-echekwa anyị mana anyị ahụghị isi nkwa ahụ mana oge rue ndị obodo ahụ achụgharị anyị merụwa ndị mmadụ ahụ, mebisia ahịa anyị."" Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka gọọmenti Naijiria na nke mba Gana nwekọ mkparịtaụka iji mee ka nsogbu ahụ bịa na njedebe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43986135,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43986135,Naanị onuku ga-ekweta na Buhari emela ọfụma - Obasanjo,Onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo agọnarịala ịkwado Onyeisiala Buhari Muhammadu.,"Okwuru na naanị ndị bụ onuku ga-ekwete na Buhari emela ọfụma n'obodo Naịjirịa. Obasanjo kwuru nke a iji gọnarị akụkọ na-agagharị na sọshal midia na ya na-etozi Buhari n'ihe ọ na-arụ. O boro okwu a n'isi ndị na-edufu Buhari nakwa ndị na-achọ ka ọ banye ọchịchị n'ụzọ ọbụla. Obasanjo kwuru na kama ndị na-akwado Buhari ga-agba mbọ dozie akụnaụba obodo, ha na-ebugharị okwu ụgha. N'okwu ya,""Agaghị m akwado ọdida. A tụgharịbeghị m n'akwụkwọ m degara Buhari n'ọnwa Jenụwarị 23 nke afọ a."" Ndị obodo ma na m kwuputara maka ụbịam, ebighi n'udo, ya na ihe dika mgbasa Naịjirịa nke adighi ike ọchichị Buhari butere. ""Aga m na-ekwuputa ihe dị n'obi m. Onweghị okwu ụgha ọbụla nwereike ikwusị ndị Naịjirịa ịchọta ọnye ọchịchị ọhụrụ."" Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe Gbasara nzukọ Donald Trump na Buhari mere n'oge na-adighị anya,Obasanjo kwuru na ọ huru isiokwu ato ndị a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" egwuregwu-44776464,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44776464,Ronaldo adịla njikere ịgafe Juventus,Cristiano Ronaldo na-agbara Real Madrid bọọlụ adịla njikere ịgafe otu bọọlụ Juventus dịka Real Madrid kwuputara.,"Ronaldo bụ onye kachasị enye goolu n'otu Real Madrid Otu bọọlụ abụọ ndị a kwekọrịtara n'ọnụ ego dị nde paụnds otu narị na ise (£105) iji hụ na Ronaldo bụ onye nọrọ afọ itoolu na Real Madrid mere njem a. Ronaldo mabutere iko Uefa Champions League anọ mana mmekọrịta ya na onyeisi otu real Madrid bụ Florentino Perez, adịchaghị mma n'oge ya na Madrid. N'okwu Ronaldo, ""Oge abịala imepe ọgbọ ndụ ọhụrụ na ndụ m, ọ bụ ya mere m ji sị otu bọọlụ a nabata orire m."" Onye otu ya bụ Sergio Ramos kwuru etu ọ dị ya n'ahụ na Ronaldo na-apụ: End of Twitter post, 1 Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50122504,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50122504,Kogi State: Edward Onoja abụrụla osote Gọvanọ Kogi steeti,Edward Onoja aṅụọla iyi ọrụ dịka osote Gọvanọ nke Kogi steeti.,"Nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti nyochara ya were nye ya akara ntụrụugo ka ọ bụrụ osote Gọvanọ. Ọ bụ ọkaikpe kachasị na Kogi steeti bụ Nasir Ajana duru ya n'iyi ọrụ n'ihu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahya Adoza Bello na ndị omeiwu ndị ọzọ. Cheta na nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti chụpụrụ Simon Achụba dịka osote gọvanọ maka omume ha sị rụru arụ n'abali atọ gara aga. E mere Achuba osote Gọvanọ n'ọnwa Febrụarị n'ime ọnwa ole na ole o si otu 'Peoples Democratic Party' were banye 'All Progressive Congress'. Idemmiri achụsasịala ndị bi n'Isheri na Legọọsi. Mgbe Gift Andrew onye ntaakụkọ BBC gara ji anya ya hụ ihe na-eme, ọ hụrụ na ndị mmadụ agbasasịala hapụ ụlọ ha niile maka idemmirị. Ndị bi ebe a ekwuola na ha enwebeghi ọkụ kemgbe oge tere aka. Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-ebo gọọmenti na ha na-anara ụlọọrụ na-akụ azụ aka azụ iji dọtị oge ha kwesiri iji gbahapụ mmiri n'ebe eji mmiri emepụta ọkụ akpọrọ ""Dam."" BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ onyeisi ""River Basin Authority"" nke Ogun na Osun steeti mana onyeisi ngalaba ahụ bụ Olufemi Odufemi kwere anyị nkwa ịwepụta ọsịsa ya n'akwụkwọ ozi azabeghị anyị ruo ugbua. Ndịagha egbuola onye ntọ na Kaduna Ndịagha na-agbalị imegide ndị omekome ọkachasị n'okporo ụzọ Abuja-Kaduna Iko otu onye ntọ ejula dịka ndịagha gburu ya ma wakpo ogige abụọ ha si arụ ọrụ na Chikun dị na Kaduna steeti. Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ. O bụ Ezindu Idimah kwuchitere ndị nchekwa anya uhie uhie a bụ nke 'Operation Whirlp Punch' were sị na ha napụtara ndị nto a otu egbe, ogbatumtum atọ, n'ihe ndị ọzo. Gọọmenti etiti ebitela ego maka ọkụ latrịk Mịnịọ̀ta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed na onyeisi otu IMF bụ Christine Laggard Gọọmentị etiti na-ekwu na ha ka na-agbasi mbọ ike iji mee ka ọkụ latrik na-adị mgbe ọbụla na Naịjirịa. Iji mee nke a, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru na ụlọakụ mba ụwa ekwela ibinye Naịjirịa ijeri dọla atọ. Ahmed kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe e mechara nzụkọ nke ndị 'World Bank' na ndị 'International Monetary Fund' na-eme kwa afọ. Ọ kọwara na ego ahụ ga na-abịa na nkeji na nkeji bido n'ọnwa Eprel nke afọ 2020. Ahmed kwukwara na ego ahụ nwere ike ịrị ruo ijeri dọla anọ. Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba. A chọtala onye uweojii ndị ntọ tọọrọ Ndị uweojii agbapụtala otu onyeisi ha atọọrọ na Suleja, Niger state, na mgbede Satọọde. Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na ha tọhapụrụ onyeuweojii ahụ na mgbede ụbọchị ụka. O kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ a na-eche na ha so na ndị ntọ ahụ. Na Kaduna Akụkọ ka na-apụta na Kaduna ebe ndị uweoji tọhapụrụ mmadụ dị otu narị na iri anọ na asaa bụ ndị a kpọchiri n'otu ụlọ n'ụbọchị Satọdee. Ndị uweojii kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ahụ bụ ndị atụrụ ịga n'ụkwụ na aka ihe karịrị afọ asatọ. Ha kwukwara na ha amalitela ịkpọghachi ha n'ezinụlọ ha. Ngagharịiwe na Chile Demonstrators clash with a riot police vehicle in Santiago Mmadụ ise nwụrụ na mba Chile mgbe ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ụlọorụ na-arụpụta akwa ọkụ n'ụbọchị ụka. Ngaghrịiwe a bụ maka mbuli e buliri ọnụego ụgbọ oloko. Ndị ọchịchị mba ahụ ebutuola ọnụ ego ahụ ka ọdịkwa ka ọ dị na mbụ, mana nke ahụ emeghị ka ngagharịiwe kwụsị. Ndị kpara opke agbụrụ Anwuchiela mmadụ abụọ bụ ndị nkwado egwu bọọlụ maka ikpa oke agbụrụ na asọmpi ntozu FA cup na etiti Haringey Borough na Yeovil Town n'Ingland. Agwa a rere ure mere ka akwụsi asọmpi a. Man Utd vs Liverpool Manchester United tetara n'ụra ụbọchị ụka na asọmpi ha na Liverpool nke biri n'onye lawa onye lawa. Liverpool che na ha ga-agwọ Man Utd ka abacha, mana ha chọpụtara na ọbụghị etu akị ilu si ada n'ọnụ ka o si atọ. Gere nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: ""Igbaji ụkwụ emeghị m onye arịrịọ""" afirika-52454724,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52454724,Coronavirus Immunity: I nwereike ibute coronavirus ugboro abụọ?,Ahụ igbochi ọrịa bụ isisekpuntị n'okwu banyere ọrịa coronavirus.,"Nje coronavirus Nsogbu bụrụ na onweghi anyị matụrụ obere ihe. Kedụ etu ahụ anyị ga-esi gbochie coronavirus? Akụrụngwa mgbochi ọrịa bụ ihe na-ebuagha n'ahụ anyị megide nje ọbụla ma ọ na-abịa n'ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ nke na-apụ ibuagha ngwa ngwa ọrịa batara n'ahụ mmadụ, gụnyere iwepụta kemịkalụ nakwa ọbara ọcha na-emebisi ebe ọrịa ndị ahụ metụtara. Mana ụdimịrị nke a apụghị ibuagha megide maọbụ chekwaa gị n'ebe ọrịa coronavirus nọ. Ihe ahụ gị chọrọ bụ nke a kpọrọ 'Adaptive Immune' bụ nke ga-esogide ọrịa ahụ iji gbochie ya nakwa nke ga-ebuso ya agha. Ọ na-ewe ahụ mmadụ abalị iri ịmịpụta akụrụgwa ga-ebuso ọrịa coronavirus agha. Onye kachasị arịa ọrịa na-ewepụta nke kachasị sie ike. Ọ bụrụ na 'Adaptive Immune' a siri ike, ọ ga-echekwa ahụ mmadụ megide ọrịa ruo oge dị anya n'ọdịnịhu. Oge ole ka nchekwa ahụ ga-anọ ruo? Ncheta mgbochi ọrịa dịka nke mmadụ, mgbe ụfọdụ ọ na-echeta ụfọdụ ọrịa nke ọma ebe ọ na-echefu ụfọdụ. Ọrịa coronavirus a kpọrọ Sars-CoV-2, anọtebeghi anya nke iji mara oge mgbochi ahụ ga-anọ, mana e nwere coronavirus isii ọzọ nwereike ịtụpenye azụ maka nke a. Anọ n'ime ha nwere njirimara ha dịka oyi ma mgbochi ya anaghị adị anya. Nyocha kwuru na onye rịaburu ọrịa a nwereike ibute ya ọzọ n'ime out afọ. Mana e nwere coronavirus abụọ ọzọ na-akpa ezigbo ike - Ndị nke bute ọrịa iku ume a kpọrọ ""Severe Acute Respiratory Syndrome (Sars) na Middle East Respiratoy Syndrome (Mers)"". Nke a hụrụ mgbochi ya dịka afọ ole na ole gachara. ""Ajụjụ abụghị ma ị ga-enwe mgbochi nye ọrịa a, kama ruo mgbe ole"" Paul Hunter bụ ọkanmụta ahụike na Mahadum East Aglia kwuru. O kwukwara ""O doro anya na ọ gaghị anọte aka n'ogologo ndụ"". Ọ bụrụ na mgbochi ahụ mmadụ esichaghị ike n'ebe ọrịa Sars nọ, ọ gaghị ejide onye ahụ etu o si jide ya n'oge mbụ ọ rịara ya. Nchekwa ahụ nwereike ịmetụta ọgwụgwọ nje coronavirus Uru na ọghọm dị na mmadụ isi n'ụlọ arụ ọrụ Ndị mmadụ o butetụla ọrịa a ugboro abụọ? E nweela akụkọ ndị butere coronavirus karịa otu ugboro n'etiti oge na-adịghị anya. Ụfọdụ sị na ndị mmadụ na-ebuta ọrịa a ugboro abụọ. Ebe ndị ọzọ sị na ọ na-ezo n'ime ahụ mmadụ ruo mgbe ọ ga-apụta ihe ọzọ. Mana nyocha Sayensị kwenyere na ọ bụ nsogbu emeghi nyocha nke ọma mere e ji agwa ndị mmadụ na o buzighi ọrịa ọzọ. Enwebeghi mmadụ amaụma bunye ọrịa a ugboro abụọ iji nyocha ikike nchekwa ahụ ya kama ọ gwụla enwe abụọ. Mana nyocha ziri na ha egosighi njirimara ọrịa a n'obere oge ha butere ya nke ugboro abụọ. 'Disinfectant' anaghị agwọ coronavirus M nwere akụrụngwa mgbochi, enwere m nchekwa? Nke a abụghị owuweanya na mmadụ agaghị ebute ọrịa a, ya mere otu World Health Organisation ji gbarụọ ihu nye mba ndị ji akwụkwọ a kpọrọ 'Immunity Passports' na-ebuli mmachi ngagharị na mba ha. Atụmatụ bụ na ọ bụrụ ime nke ọma nq nyocha akụrụngwa mgbochi, I nwereike ịlaghachị n'ọrụ. Nke bara uru nye ndị ọrụ ahụike na-ezutekarị ndị na-egosi njirimara ọrịa n'ebe o buru ibu. Akụrụngwa mgbochi dị mmadụ n'ahụ dị icheiche, ndị a na-akpọ 'Neutralizing antibodies' bụ ndị na-akpagbu ọrịa ahụ ka ọ ghara imetu mpaghara ahụ ndị ọzọ. Nyocha e mere mmadụ 175 gbakere na Chaịna gosiri na pesentị 35 n'ime ha nwere 'neutralizing antibodies' n'ogogo obere. Ya mere World Health Organisation ji sị na akụrụngwa ' Adaptive Immune' nwereike dị oke mkpa na mmadụ ịgbake n'ọrịa a. Ihe ọzọ bụ na-agbanyeghi na i nwereike nwe nchekwa n'ebe ọrịa a nọ kama ọ pụtaghị na i nweghi ike ibu ya n'ahụ gị ma bufee ya onye ọzọ. Etu coronavirus si metụta emume 'Holy Week' nke afọ a Kedụ Ihe mere nchekwa ahụ ji dị mkpa? Nchekwa ahụ dị mkpa n'ụzọ dị icheiche, ma ị ga-ebute ọrịa Covid-19 karịa otu ugboro nakwa oge ole ọ ga-ewe. Nchekwa ahụ a na-emetụta ụdịrị ike ọrịa ga-akpa n'ahụ. Ọ bụrụ na i nwere ya na-agbanyeghi nwa obere, ọ ga-ebelata ụdị ikike ọrịa a n'ahụ gị. Ị ghọta ọnọdụ nchekwa ahụ ga-enye aka ibuli mmachi ngagharị, nke bụ na a ga-ama ụdịrị ndị ọrịa a ga-emetụta karịa nakwa ndị nwereike ikesa ya. Ọ bụrụ na o sie ike imepụta nchekwa ga-anọte aka, ọ ga-enyekwa nsogbu ịrụpụta ọgwụ. Maọbụ gbanwee etu a ga-esi ṅụọ ọgwụ ahụ - ọ ga-abụ otu ugboro na ndụ kaọbụ otu ugboro kwa afọ? Ogologo oge nchekwa ahụ ga-anọ, ga-agwa anyị etu e nwereike iji gbochie mfesasị nje a. Ihe ndị a bụ ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị na-ajụ, nke a na-enwetebeghi ọsịsa ha. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-51018114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018114,"Iran Vs America: Amerịka achọghị ọgụ, anyị chọrọ ọdịnihu Iran- Trump",Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na mba Amerịka chọrọ udo dịka o siri gbasa okwu ha na mba Iran.,"N'ozi ọ gbasara ụbọchị Wenezde, Trump gwara mba Iran sị: ""Ndị Iran na ndị udu ha, anyị anyị chọrọ ka ụnụ nwee ọdịnihu, nnukwu ọdịnihu kwesịrị ụnụ, ọdịnihu ya na ọganihu na otu nkwekọrịta so. ""Mba Amerịka dị njikere ikpe udo."" ""Okwu a na-abịa dịka mna Iran zipuru ogbunigwe n'ọnọdụ ndị agha mba Amerịka na mba Iraq."" Okwu a na-abịa dịka mba Iran zigara ogbunigwe n'ebe ndịagha kwara ọnọdụ na mba Iraq. Ikpeazu, Okowa aghọọla a kwaa a kwụrụ n'oche gọvanọ Nke dapụtara n'ehihie Wenezde bụ na ụlọikpe Kachasị na Naijiria enyela Okezie Ikpeazu nke Abia, Ifeanyị Okowa nke Delta mmeri n'ikpe onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia nakwa Delta e mere n'ọnwa Maach afọ 2019. Alex Otti nke APGA gbaghara mkpọpụta Inec kpọpụtara Ikpeazu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ na traibunal nakwa n'ụlọikpe mkpegharị. Mana mkpesa ya kụrụ afọ n'ala nke mere ka o wega ikpe ahụ n'Ụlọikpe Kachasị. Okowa kwụkwa chị dịka Gọvanọ Ifeanyi Okowa bụ gọvanọ nke atọ na-enyocha ọdọ ụgbọelu nke a Ụlọikpe kachasị nọkwa taa kpebie ka Ifeanyị Okowa nosie ike n'oche ya dịka Gọvanọ Delta steeti. Great Ogbaru na pati ya bụ APC gbaburu akwụkwọ iji mgbaghaa mmeri Okowa n'ụlọikpe Kachasị. Gọvanọ Bello nke Niger sokwa Abubakar Bello Gọvanọ Niger steeti bụ Abubakar Bello sokwa na ndị isima dịka ụlọikpe Kachasị gwara ya lawa n'ikpe amaghị ya n'ikpe onye meriri n'ọkwa Gọvanọ steeti ya. Mohammed Nasko nke PDP gbaburu mmeri Bello n'ụlọikpe. Darius Ishaku nke Taraba Steeti Ụlọikpe Kachasị kpebikwara na Gọvanọ Taraba steeti bụ Darius Ishaku kabụkwa onye ji oche Gọvanọ steeti n'ihi dịka ha siri kwuo, APC enweghị onye ha wepụtara ịzọ ọkwa ahụ n'aha pati ha. Anwuchiela ndị ntọ ise n'Abia Ndị uweoji Naịjiria Aka ndị uweojii agbarala ndị ntọ anọ na otu onye dibia na-agwọrọ ha ọgwụ na Amapụ-Ngwa ebe ha zoro. Onu na ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffery Ogbonna kwuru na a nwụchịrị madụ ise a maka mwakpo ha na-awakpo ndị na-eme njem n'okporo ụzọ sị Umuahia gawa Aba. Ozu nwatakịrị a hụrụ na 'Air France' A na-eche na onwere ike ị bụ oyi tugbụrụ nwantakịrị ahụ A hụtara ozu nwatakịrị gbara afọ iri n'ụgbọelu Airfrance dịka o si Ivory Coast were bia Fransị. Ndị Airfrance na-akọwa na nwatakịrịa zọfụrụ onwe ya iji ụzọ a were bata obodo Fransị. Iran Plane Crash: Lee mba ndị kwọpiara n'Ụgbọelu Ukraine dara n'Iran A na-ekwu onye o nweghị onye pụtara na ndụ na ya bụ ọdachị Ụlọ nnọchite anya obodo Ukraine dị n'Iran ekwuola na mmadụ otu narị na iri asaa nọ n'ụgbọelu kpọkasiri n'Iran si na mba asaa. Mmadụ ihe ọdachị a metụtara gụnyere ndị Iran iri asatọ na abụọ(82), ndị Canada iri isii na atọ (63), Ukraine iri na otu(11), ndị Swede iri(10), ndị Britein atọ, Afghan anọ (4), nakwa ndị Germany atọ(3) dịka Praịm Minista mba ahụ si kwupụta Ha kwuru na ọ bụ nsogbu engine butere ọdịda ụgbọelu ahụ. Ụgbọelu Ukraine akpọrọ Boeing -737 bu mmadụ narị otu na iri asaa akpọkasiala na mba Iran. Ụlọrụ Iran Red Cresent kwuru na ha cheghị na ndị mmadụ dị ndụ ga-apụtalị n'ụgbọelu ahụ. Ụgbọelu ahụ nke ọ bụ Ukraine International Airlines nwe kwọkasiri ka o felichara elu site n'ọdọ ụgbọelu Imam Khomeini Iran nke dị na Tehran dịka ụlọọrụ mgbasaozi 'Fars state news agency' si depụta. Amabeghị ma ya bụ ọdachị o metụtara esemokwu dị n'etiti mba Iran na US. Ezigala ndị ọrụ gbata gbata ebe ihe a mere ka ha nye aka. N'Egwuregwu Victor Sanchez del Amo Ndị otu egwu bọolụ Malaga nke Spen akwụsịla onye ndụ ha bụ Victor Sanchez del Amo ọru dịka ewepụtara ihe onyonyo gosiri ebe o ji ihe o ji bụrụ nwoke egwuegwu. Kama Sanchez kwuru sị na nke a bụ nkata iji iyi ya egwu ka a napụta ya ego n'aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'" afirika-47188820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47188820,Mmadụ 7 anwụọla n'ọkụ tanka gbara n'Anambra,Mmadụ asaa n'ime mmadụ asatọ anwụọla ka ọkụ tanka gbara n'Amawbia dị n'Awka.,"Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambra state kwuru na ọkụ a gbara ụgbọala ruru asatọ ma mebie ụlọ na ụlọ ahịa ha agụtabeghị ọnụ. Haruna kwuru na ihe mberede a n'elekere asatọ n'ụma nke abalị Februwarị asatọ n'okiri okiri Amawbia dị n'Awka. N'ọkwu ya, ""onye ọkwọ ụgbọala ahụ bụ mmanụ ugbọala na-achọ ka ọ gafee okiri okiri , wee nọrọ n'etiti mgbagoju anya, ụgbọala ya wee gbahapụ nwuru ọkụ. O kwuru na ebugala otu onye ka dị ndụ n'ime ndị ọkụ tanka a gbara n'ụlọ ""Nnewi Teaching Hospital"". Haruna kwuru na ya na ndị otu ya nọ na-akwalisi ihu ebe ihe a mere ka ụzọ were gara ndị ọzọ were were. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-47750496,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47750496,Imo state: Ndị uweojii ejidela onye ha na-enyo gburu ọkaikpe n'Imo,"Ndị uweojii Imo steeti gosiri agbaala n'anwụ Friday Nnaekezie bụ otu nwoke gbara afọ 34, a na-enyo na aka ya dị n'ogbugbu e gburu otu ọkaikpe nke ụlọikpe Majie dị n'Uburu, n'okpuru ọchịchị Oru-West.","Onye a na-enyo enyo na o gburu ọkaikpe Ndị ntọ mmadụ amaghị ndị ha bụ tọrọ Remi Chukwujieze Ogu n'ụlọ onye odeakwụkwọ Majie bụ Uju Nwanne n'Amaifeke, n'okpuru ọchịchị Ọlụ n'Imo steti, n'ụbọchị Nọvemba 22, afọ 2018. N'ozi o zipuru, kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Dasuki Galadanchi kọwara na a hụrụ ozu ọkaikpe a n'abalị Nọvemba 23, afọ 2018 n'okporoụzọ gara Amụcha nke dị n'okpuru ọchịchị Njaaba, ebe e kpuchiri ihu ya ma dekwasị ihe odide bụ ""SNAP 55"" n'aka ya, ebe e jikwa mgbọ egbe were saa ya ahụ. O kwukwara na ntuziaka o nyere, mere ka ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka igbu ọchụ a kpọrọ ""Homicide section"" banye nnyocha bụ nke mere e ji nwụchie nwaamadị a bụ onye Eziama Ubulu. Kọmishọna a kọwara na Nnaekezie gbagara na Legọs mgbe ọ kpachara arụ a; bụkwa ebe e jidere ya. Dịka o siri kwuo, Nnaekezie kwupụtara na ya kpọtara mmadụ atọ ọ kwụrụ puku narị ise (N500,000), bụ ndị nọ n'ọsọ ugbua, ma tinyere onwe ya oge iji gbuo nwoke a o boro ebubo na ya na nwunye ya na-eme enyi. Akụkọ ga-amasị gị:" 47690664,https://www.bbc.com/igbo/47690664,Inec: A kwụsịla ikesa asambodo mmeri na Zamfara,"Dịka Inec sị akwado ikesala asambodo mmeri na steeti dị icheiche, Zamfara esoghi na steeti ebe a ga-eke asambodo na Wensde 27 Maachị, afọ 2019.","Inec akwụsịla nkesa asambodo mmeri na Zamfara Legọs gụnyere ebe ndị agaghị enye echi n'ihi na ebufeela ụbọchị a ga-enye asambodo mmeri ruo ụbọchị Fraide 29 Maachị, afọ 2019 Ha kọwara n'akara Twitter ha na ọ bụ iwu ụlọikpe nyere ka ha jiri kwụsị ya bụ emume a kwadoro mbụ. ""Anyị na-eleba anya n'ikpe ụlọikpe nyere gbasara ndị na-azọ ọkwa n'okpuru otu APC"" so na nkọwa ha nyere. End of Twitter post, 1 Dịka ọ dị ugbua amabeghi mgbe ha ga-emecha nyocha maọbụ kesa ya bụ asambodo ndị mmeri kwesiri ịnweta. 'PDP ohere adịghịrị unu n'ọchịchị a' -Oshiomole Adams oshiomhole onyeisi APC Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole ekwuola na onweghị ihe ga-eme ka APC nabata PDP na ọchịchị nke agbaa. Oshiomhole kwuru nke a mgbe ndị pati ha nwere ọgbakọ n'Abuja ụbọchị Monday bụ ebe ha nọkwa kapịa ọnụ maka ndị ha ga-ahọpụta ga-abụ ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta. Gọvanọ Abubakar ekelela Bala Mohammed maka mmeri ya Gọvanọ Abubakar nke Bauchi onye ji ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2019 ebunyela okpokpo ekele ga onye meriri ntuliaka Bauchi steeti bụ Senator Bala Mohammed. O mere nke a site n'akara Twitter ya: Egbuola Nọsụ n'Enugwu Aka ndị uweojii akparala mmadụ abụọ ana eche na aka ha dị na ogbugbu nwaanyi nọsụ na-arụ ọrụ na Federal Psychiatric Hospital, Enugu. Maria Amadi na-abanye n'ụlọ ya na Trans Ekulu mgbe ndị omekome ji egbe napụ ya ndị ya n'ike ụbọchị Tọzde gara aga. Izrel ebusola Hamas agha ọzọ Ọkụ ogbunigwe na Gaza Izrel amalitela ịtụ ogbunigwe na Gaza strip bụ nke a sị na-ometuru ụlọ onyeisi ndị Hamas. Izrel sị na ọ bụ Hamas bụ ụzọ tụbata ogbunigwa na Mishmeret nke Izrel. Onyeisi mba Izrel bụ Benjamin Natanyahu dọrọ aka na ntị na ya agaghị anabata ụdị egwuruegwu ahụ. Nigerian Olympic Eagles N'egwuruegwu e, Victor Osimhen eturula ugo dịka onye nyere golu atọ na-otu asmopi bụ nke ndi Nigerian Olympic Eagles ji merie ndi Libya n'Asompi iko mba Afrika agbara n'Asaba ụbọchị Monde. Nigeria ji ọkpụ ano achitaghị aja merie Libya iji gbara isi onwe ha na ọkpụ abụọ Libya gbara ha na-asompi ndị ntorobia nke Afrika. Nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" egwuregwu-45199775,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45199775,Victor Moses dị afọ 27 alaala ezumike nka n'egwuregwu bọọlụ Naijiria,Victor Moses ọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ ma a kpọkuo ya?,"Ka Moses kwuputara na Twitter na ọ wụsala boot o ji agbara Naịjirịa bọọlụ, ọ bụrụla ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ. Moses dị afọ 27, gbaara Naịjirịa bọọlụ ugboro 37 ma nye goolu ugboro 12, n'agbanyeghị na o bu ụzọ gbaara Ịngland na ngalaba U-21. Iji kwuputa maka 'boot' ọ wụsara, Moses dere sị ""ọtụtụ ihe ọma merela na ndụ m mere ka m yi uwe ndị Super Eagles, agaghị m echefu ya na ndụ m niile. ""Mana ugbua bụ oge kacha mma iji lekọta ezinaụlọ m nakwa klụb ebe bụ ụlọọrụ m, nakwa inye ndị na-etolite ohere iji pụta n'ọgbọ mee ọfụma. ""Daalụ maka ihe niile, ya gaziere otu a n'ọdịniihu."" Cheta na Moses so Naịjirịa bulie Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, ma sorokwa ha gaa Iko Mbaụwa abụọ n'afọ 2014 na nke 2018. Nne na nna Victor Moses nwụrụ na mwakpo ndị omekome mere na Kaduna oge ọ dị naanị afọ 11 Moses nyere goolu abụọ n'asọmpi Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, nke nyere Naịjirịa ikike iji gafee agba mgbapụ. O nyekwara otu goolu ka Naịjirịa na Ajentina zukọrọ n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa na 2018. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-44788808,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44788808,E nwereike ịgbachi akwa mmiri 'Third Mainland',Gọọmentị etiti ga-agbachi akwa mmiri ''Third Mainland'' nke dị na Legọsị.,"A rụrụ akwa mmiri 'Thirdmainland' na 1990 n'ọchịchị Ibrahim Babangida O kwuputere ihe a site n'ọnụ onye na-ahụ maka ọrụ okporouzọ na Legos akpọrọ Adedamola Kuti. Kuti kwuru na a na aga-enwe mkparịtaụka maka ịgbachi ma mezie ya bụ akwa mmiri. Akwa mmiri a bụ ebe ọtụtụ ndị bi na 'Mainland' sị ebi ije ha nke nke ma ha na-eje ''Island'' ma bụrụkwa ebe esi eje ọtụtụ ụlọ azụma ahịa na ọrụ bekee dịkwa. Kuti kwukwara na ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-ezukọ taa ka ha wee kpaa ka a ga-esi gbochie ntaramahụhụ mmezi a nwereike ibutere ndị ọkwọ ụgbọala nesikarị ụzọ ahụ agafe. O kwughị oge a ga-agbachị okporoụzọ akwa mmiri a maọbụ mgbe a ga-ebido mezi we ya mana o kwuru na e nereiek ị gbachi ya na elekere 12 nke nderi nke ụbọchị Julai 12 ka ha wee lele ya ọfụma ma mezitu ya tupu ha emepe ya ụbọchị ụka n'ime abali. N'ọnụ ya, ''ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-abia nzukọ a gụnyere ndị ọrụ nhazi ụgbọala na-aga n'okporoụzọ,ndị na-ahụ maka njem okporoụzọ, ndị na-akwọ gwongworo nakwa ndị ọkwọ ụgbọala, ndị uweojii na ndị ọzọ. Na ọnwa May nke afọ a , Ka ndị so n'oche ochịchị onyeisiala akpọrọ Federal Executive council na bekee binyere aka n'akwụkwọ kewapụtara ọnụ egọ Ijeri naira 18 na ọkara maka mmezi na nchekwa akwa mmiri a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 45536671,https://www.bbc.com/igbo/45536671,E kwesiri inwuchi Kemi Adesoun - PDP,Otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) na Bekee akpọla oku ka gọọmenti etiti nwụchie Kemi Adesoun na-egbughi oge ọbụla.,"Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ụbọchị Sepụtemba 14 PDP nọrọ n'akara ya na twitter taa wee kwuo na ọ bụ ezie na Adeosun ejirila aka ya tinye akwụkwọ arụkwaghị m mana o kwesiri ịga nga maka ihe o mere. Ihe ndị ahụ ha gụpụtara gụnyere na o feghi ala nna dịka iwu nyere ma jirikwa asambodo adịgboroja iji gosi na a gafere afọ ime ya. Ha kwuru na onyeisiala Buhari enweghi ike ịchụ Adeosun n'ọrụ garuo mgbe o jiri aka tinye akwụkwọ nke pụtara na ọ bụrụ na otinyeghi akwụkwọ ahụ, ọ kara ịnọ n'ọkwa ruo ugbua. PDP gara n'ihu kwuo na nyocha ha na-ekwu na gọọmenti etiti chọrọ inyere Adeosun aka ka ọ ghara ịta ahụhụ njọ ya ebe ha boro ebubo na gọọmenti a na-ekpuchi ndị ọjọọ na ndị na-eme mpụ. Ha kwukwara na gọọmenti etiti chọrọ izupu Adeosun gaa mba ofesi ebe ha kporo oku nye ndị otu mbaụwa ka ha hie asaa n'anya ịhụ na a chụlatara ya ma ọ gaa mba ofesi. PDP kwuru na ihe ha chọrọ bụ nyocha tọrọ atọ banyere akwụkwọ niile dị n'ụlọọrụ ya oge ọ rụrụ ebe ahụ ebe ndekọ niile dị iji gosi magu magu e mere oge ọ bụ mịnịsịta. Cheta na Kemi Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ụnyaa nke gọọmenti natara ka ụmụ naịjirịa tigidere mkpu maka ya ebubo megide Adeosun. Ndị ntaakụkọ Premier Times bụ ndị mere nyocha chọpụta n'asambodo NYSC nke Adeosun ji arụ ọrụ bụ nke adịgboroja mana Adeosun ekwuola na ya amaghị na nke ahụ bụ eziokwu. Adeosun kwuru na ọ bụ ndị ọ tụkwasịrị obi bụ ndị wetara ya akwụkwọ ahụ nke ya na-amaghị na ọ bụ nke adịgboroja rue oge akụkọ ahụ pụtara. Mana ajụjụ ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ajụ n'igwe soshal midia gụnyere ndị PDP bụ ma ọ ga-atakwa ahụhụ so ya bụ ihe o mere ma ọ bụrụ n'ezie o mere ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44263475,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44263475,Ndị Ireland ekpebiela na ụmụnwannyị nwere ikike ite ime,Ndị mba Ireland mere ntuliaka taa iji kagbuo otu usoro iwu na-achi mba ahụ nke ehiwere n'afọ 1983 bụ nke tinyere nwaanyị na nwa o bu n'afọ n'otu ogogo.,"Obi ndị mmadụ dị na ntụlịaka emere Ndị mmadụ were usoro iwu ahụ ka ihe gbochiri nwannyị dị ime ite nwa o bu n'afọ. Ọgụgụ nke enwetere ugbua na ntuliaka nke taa na-egosi na percentị 68 na mba ahụ chọrọ ka-akagbuo ya bụ iwu, percent 30 n'ọma chọrọ ka-ahapụ ya etu ahụ ọ dị. Usoro tụgharị iwu ji obodo nke asato bụ ihe emere n'afọ 1983 Onye na-ekwụchitere ndi chọrọ ka ya bụ iwu nọọdụ bụ John McGuirk ekwenyerela na ndị chọrọ ka-akagbuo ya emeriela. ""Ndị be anyị entinyela ọnụ na ya bụ okwu, okwu wee danyere ndị ọzọ, agbanyeghi na m chọrọ ka ọ bụrụ etu ọzọ ka ọ pụtara,"" McGuirk kwuru. Ụmụaka na okenye pụtara ebe a na-eme ntulịaka Taoiseach Leo Varadkar, so na ndị kwenyere ka-akagbuo iwu a kwuru na mmeri a ga-abụ ihe a ga-eji maa atụ site eche gawa n'ihu. Echi ka a ga-akpọpụta aha ndị meriri n'ezie. McQuirk gakwara n'ihu kwuo na iwu a akagburu pụtara na ndị omeiwu enwere ikike iji hiwe iwu ga-enye ohere ka a na-egbu ụmụaka n'ebe ha. ""Anyi agaghị ikwe,"" o kwuru." 43636118,https://www.bbc.com/igbo/43636118,Kukah: Ọgbaghara ga-ada na 2019,Bishọp nke Sokoto Katọlik Dayọsis bụ Bishọp Mathew Kukah ekwuola na ọgbaaghara nwere ike ịda na Naịjiria dịka ime ntụlịaka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 nna-abịa nso.,"Bishọp Kukah sị na mwufu obara na mmebi akụnaụba obodo Naịjiria karịrị akarị. Ọ sị na onweghị ịhe ga eme ka ọgbaaghara aghara ịda na Naịjirịa ma ọbụrụ na akwụsịghị ọgụ na mgba a n'ada ebe niile na Naịjirịa. Kụkah kwuru nke a na-ozi ya na Africa Report Magazine nke Eprelu. Bishọp Kukah kwuru na ọ ga ata akpụ ị gbanahụ ọgbaaghara na ntụliaka nke 2019. N'ọnụ okwu ya, ""ọ ga abụ ezigbo ọlụ ebube ma ọbụrụ na ọgbaaghara adaghị na ntụliaka 2019"". Akụkọ ga-amasị gị Ọ sịrị na ihe ojiri kwuo nke a bụ maka ọgụ na mgba juru ebe niile na Naịjiria ugbua. ""O metubeghị m n'obi otu a mbụ. Ekpere mụ bụ ka o metu gọọmenti n'obi ịmata ụdị iwe dị ndị mmadụ n'obi"". O kwuru na ọnọdụ Naịjirịa ugbua kwesiri ịna-emetu nwafọ obodo a ọbụla n'obi. Kedụ maka ijeri dọla gọọmenti weputere maka nchekwa obodo? Mgbe Bishọp Kukah na BBC gbaritara ụka anyị jụrụ ya maka nde naịra gọọmenti tinyere na-chekwa obodo. Bishọp Kukah zara na ihe kacha mkpa abụghị ị me gbanụgbanụ me ihe ga enye aka ị me ntụliaka ọchịchị nke ga eme ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị biwakwa ndụ okeọzụ ka ha si ebe, nke a gaghị abara ndị ha n'achị ụrụ. Ọ sị na tupu udo abata na Naịjirịa na nkwafu obara ga akwusị kpamkpam. Bishop Kukah zara na ajụjụ a sị: ""Ejighị ego egote udo. Nụrụ ihe okwuru na ụjụ na asụsụ bekee. Bishop Mathew Kukah ekwuola n'ọgbaghara nwere ike ịda na ndụliaka 2019 ma ọdịrị otua gawa. ""Ọbụghị ụkọ ego mere na udo adịghị na Naịjirịa, ka ma ọ bụ oke ego dị na obodo a kpatara ya. ""Etinyela otụtụ ego na ndọrọndọro ọchịchị onweghị isi. ""Ya bụ itinye ọtụtụ egọ abụghị nsogbụ, ọkachasị na obodo ihe niile bụ ego dịka Naịjirịa. ""Gọọmenti etinyela ọtụtụ ego na mmiri, anyị enweghị mmiri. Ha etinyela ọtutụ ego na ọkụ, anyị enweghị ọkụ. Ihe ga enweta udo na Naịjịrịa abụghị egbe na mgbo."" Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme bụ ka enwe ike mee ntụliaka ọzọ ma ghara ime ihe ga-abara ndị mmadụ uru. Bishọp Kukah kwuru na ọrụ gọọmenti bụ ime ka ndị a na-achịachị nwee ntụkwasị obi na agbamume. Mana ọtụtụ ndị Naịjiria enweghị ya. Ọnọdụ dị otu a na-emebi ọchịchị onyekwụọụche ya anyị nọ n'ime ya. Kedụ ihe i chere maka ụmụaka Dapchị a tọhapụrụ? Ihe ahụ rụtụrụ aka ịgosị ka gọọmenti sị ahazị ozi a na ezigara ndị a na achị. Bishọp Kukah sị na ọbụ ihe mgbagwoju anya na ụdị ihe ahụ mere onweghị onye mara isi ya na ọdụ ya maọbụ ihe kpatara ya bụ ihe. ""Ihe a na-anụ bụ sọsọ asịrị. Ọ naghị enye aka ma ọlị. ""Nke ka njọ bụ na o nwere otu onye aka jị ejị maka okwukwe ya."" Ụdị ihe a abụghị ihe e kwesiri ị na-anụ na Naịjịrịa ugbua.Ọ jọgbụrụ ụdele ma sịgbụọ nkakwụ.""" afirika-47465842,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47465842,Kylie Jenner: Ide ji ego dị naanị afọ 21,"Ngalaba na-ahụ maka akụnaụba ndị mmadụ kpatara bụ Forbes, kpọpụtara aha Kylie Jenner dịka onye kacha pee mpe ji aka ya mee onwe ya ọgaranya.","Forbes kwuru sị na Jenner dị afọ 21 ugbua, na-arụpụta ma na-ere ihe e ji etecha ihu, bụ ọgaranya ego ya na-akwafu akwafu, mere onwe ya ọgaranya n'ike nke aka ya. Mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụghị eziokwu, makana Jenner malitere ịkpata ego site n'ihe nkiri a kpọrọ ""Keeping Up with the Kardashians"", nke ya na ezinaụlọ ya so n'ime ya. End of Twitter post, 1 Nke a mere ka Forbes tinye ọnụ kwuo sị ""Ihe anyị kpọrọ ""onye ji aka ya baa onwe ya ọgaranya"" bụ onye ji aka ya hibe ụlọọrụ maọbụ kpata ego nke ya, karịa onye ketara oke ụlọọrụ ya niile maọbụ ụfọdụ n'ime ya."" Cheta na Jenner hibere ụlọọrụ ya ọ kpọrọ ""Kylie Cosmetics"" n'afọ 2015. Nsogbu dị R.Kelly n'isi Onye otiegwu a ma ama na mba ụwa niile eji R. Kelly mara apụtala ịzara ọnụ ya n'oge, bụ kemgbe e boro ya ebubo mmetọ ọtụtụ nwata nwaanyị. N'ajụjụ ọnụ ụlọntaakụọ CBS gbara ya, R. Kelly kwuru na o dọghị anya na ya ga-ekechi ụmụ nwaanyị ma metọọ ha n'ụzọ ezighi ezi. Ọ malitekwara ịbe akwa na-ekwu ""ana m alụ ọgụ ndụ m"". Nzipu ndị uweojii Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu kwuru na o zipula ndị uweojii narị abụọ na iri itoolu na anọ gụnyere ndị osote ya na ndị kọmishọna, bụ ndị ga-enyere ndị uweojii ọzọ aka na ntuliaka a ga-eme na Satọde. O kwuru na dịka ha mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala gara aga, na ha ga-etinye uchu n'ọrụ ha ịhụ na ha chekwara ndị mmadụ na-enweghi nsogbu ọbụla na nke ntuliaka ọkwa gọvanọ a. Nkwado ntuliaka n'Ebọnyị Ndị ụlọọrụ Inec Ebọnyị steeti ekwuola na ha agaghị anabata ntuliaka ọbụla a na-ejighi igwe ""card reader"" mee. Ha kwuru na ọ bụrụ na card reader arụghị ọrụ, na a ga-eweta ọzọ, ma ọ bụrụkwanụ na nke ahụ arụghị, na a ga-ebugharị ya bụ ntuliaka ruo echi ya. N'akụkọ si mba Kenya, Ndị na-eme njem puku kwụrụ puku atọkịrịla n'ọdụ ụgbọelu anọ ha nwere, dịka ndị na-arụ ebe ahụ malitere abụbụọrụ. Ihe karịrị ụgbọelu iri isii kwesịrị isi n'ọdọ ụgbọelu Jomo Kenyatta fepụ mee njem, emenwughi ya maka ọnọdụ a. N'egwuregwu, Champions League ga-akpụ ọkụ n'ọnụ taa ka otu anọ bụ ""isi ekwe ọnwụ"" ga-ezute onwe ha. Porto ga-ezute Roma, ebe ndị Man Utd ga-achọ ịnapụta PSG isi ha. Ọzọ, Dokínta Francisca Nwafulugo ebe ọ na-anata akwụkwọ ikike ọrụ ya n'Abuja taa Ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa emeela Francisca Nwafulugo onyeisi Federal Polytechnic dị n'Oko Anambra steeti Ọ ga-eme ka Oriaku Nwafulugo bụrụ nwaanyị mbụ ga-abanye n'ọkwa ahụ kemgbe a malitere ya bụ mahadum. Na ndọrọndọrọ ọchịchị Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ gaghị akwụsị ịkatọ Muhamadu Buhari O kwuru nke a n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya ma kwuo na o nweghi esemokwu dị n'etiti ya na Buhari mana ọ bụ iji kwado ezi ọchịchị ka ọ ga-eji na-eme nke a. Na mba ofesi Ndị ọrụ gbatagbata ekwuola na mmadụ asaa si n'otu ezinaụlọ anwụola n'oke ibibia mmiri mere na mba Alabama. Ndị ahụ gụnyere ụmụaka anọ nwụrụ mgbe ibibia mmiri metụtara ụlọ ha tupu ndị ọrụ nzọpụta e nweike rute ebe ha nọ. N'egwuregwu, Francis Uzoho, Ikechukwu Ezenwa, Chidozie Awaziem, Kenneth Omeruo na ndị ọzọ bụ ndị a kpọpụtara ga agbara Naịjirịa bọolụ dịka ha na-akwado ịzute mba Egypt nakwa mba Seychelles n'asọmpị enyi na enyi n'izuụka na abịa. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: 2019 Elections: Ka ekwe chara ya nkwa '10 million naira' Ogbonnaya Okoro ekwofela PDP" afirika-49476480,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49476480,"Sinach, Angela Okorie na ụmụnwaanyị Ebonyi state Nigeria enweghi ike ichefu aha ha","N'ezinaụlọ niile, nwaanyị bụ ngalaba ji isi ụlọ, etu a ka ọ dịkwa n'Ebonyi steeti nakwa Naịjirịa.","Dịka anyị si wetara gị akụkọ ụmụnwaanyị Abịa steeti na-akpa ike nakwa ndị bụ agbara nwaanyị si Anambara steeti, anyị chọrọ igosi gị ndị nke si Ebonyi steeti. Ụmụnwaanyị Ebonyi mara mma, ma nwekwaa ụbụrụ, nke mere ka ha na-enwuke ebe ọbụla ha gara. Lee ndị meterela ihe e ji kpụrụ ha n'ọnụ: Priscilla Ekwere Eleje Ị na-agụ ego puku naịra, lezie anya ọfụma ka ị hụ mbinyeaka nwaanyị a Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya (signature) na-apụta n'ego Naịjirịa n'ime afọ iri isii na otu (61). Ọ bụkwa nwaanyị mbụ ga-anọ n'ọkwa ""Director of Currency Operations"" n'ụlọakụ etiti a kpọrọ Central Bank (CBN) n'olu Bekee, na Naịjirịa. Ọ bụkwa nwaanyị agụmakwụkwọ anaghị ara ahụ, dịka o nwere asambodo dị iche iche gosiri na ụbụrụisi ya na-apụ ọkụ. Uche Azikiwe Na Azikiwe lụrụ otu dike ala Igbo na Naịjirịa bụ Nnamdi 'Zik' Azikiwe abụghị naanị ihe aha ya ji dịrị n'ime akụkọ a. Ị ma na Azikiwe bụ ọkammụta na mahadum Nsụka? O sokwa na ndị nọ n'oche na-ahụ maka etu ihe si aga n'ụlọakụ etiti (CBN). Azikiwe so na ndị nwetarala ihe nrite Member of the Order of the Federal Republic (MFR). A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, 1947. Osinachi 'Sinach' Joseph (Kalu) Sinach agaala ọtụtụ mba dị iche iche gaa gụọ egwu ya Sinach dịka e si mara ya, bụ otiegwu pụrụiche. Ihe gbasara Chineke na ụka Kraịst na-amasị ya nke ukwu, mere ka ọ na-eti naanị egwu ụka. A ga-ekwu ole ghara ole? Ọ na-agụ agụ, ma na-edekwa ede. O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Maachị, 1973. Angela Okorie Ị jụọ mmadụ ""kedụ aha ndị a ma ama si Ebonyi steeti?"" ma ha akpọghị aha Okorie, mara na onye ahụ amaghị steeti ahụ. Okorie so na ndị aha ha na-ada ụda na Nollywood, ebe o merela ọtụtụ ejije. A mụrụ ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Ọgọstụ 1986. Charity 'ChaCha' Eke-Faani Cha Cha Eke bụ nwa kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Ebonyi steeti bụ Ọkammụta John Eke Eke bụ onye na-eme ejije na Nollywood. N'agbanyeghi na ọ ka bụ ezigbo nwaagbọghọ, o meela ọtụtụ ihe nkiri karịrị otu narị. A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee, 1993. Grace Amah Ị bụrụ onye na-ele ihe nkiri ndị Nollywood mgbe gboo, ị ga-amarịrị onye Amah bụ. Aha ya wuru ewu ọfụma oge ndị dị ka Sandra Achums, Regina Askia na Rita Nzelu ""na-achị"" Nollywood. A mụrụ ya ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị. Maria Ude Nwachi Nwachi bụ aka ochie n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti. Ọ rụọla dịka onye omeiwu nta na-anọchite anya ndị Afikpo Nọt-Ist. Ọ bụ ya hibere otu ndị Igbo kacha nwee mmadụ na Facebook. A mụrụ ya ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba, 1970. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Egwu Oke Nkwa" afirika-43719825,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43719825,London: ụmụ ntorobia itoolu anwụọla,"Nke a bụ mbụ n'ime ọnwa anọ a na-egbu ndị isi ojii dị iri ise, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ntoroọbịa site n'egbe ma ọ bụ na nma n'ime obodo Lọndọn.","Nwa ịkpe azụ nwụrụ n'ogbugbu a N'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Maachị (25 3-18), otu onye akpọrọ Abraham Badru gbara afọm iri abụọ na isii (25), nwa onye omeiwu Naịjirịa bụ Dolapu Badru nwụrụ n'aka nne ya n'ihu ụlọ ha dị na Hackney, Uk. Dịka ndị akụkọ kwuru, e ji egbe gbagbuo ya, mana ndị uweojii ahụbeghị onye gburu ya. Orughị izuụka abụọ nke a mere, n'abalị anọ nke ọnwa Epụrelụ, nwa afọ Naịjirịa ọzọ akpọrọ Isreal Ogunsola dị afọ iri na asatọ (18) nwụọ site na nma amara ya n'ahụ. Ndị uweojii ejidela otu nwata dị afọ iri na asaa (17) maka igbu mmadụ, ebe ha ka na-achọ onye ọzọ. Akụkọ ka nkụ gbasara ụmụ afọ Naịjirịa nwụrụla na Lọndọn. Ihe karịrị ikpe dị itoolu, ebe ikpe karịrị iri na asatọ dị n'aka ndị uweojii enweghị ezigbo akụkọ. Lee ndị nwụrụ kemgbe mbido afọ 2019: Oluwadamilola Odeyingbo, 18 Taofeek Lamidi, 20 Harry Uzoka, 25 Rotimi Oshinbajo, 26 Fola Odubiyi, 18 Niyi Shode, 24 Kelvin Odunuyi, 19 Abraham Badru, 26 Israel Ogunsola, 18 Ihe ndị mmadụ na-ekwu Otu onye bi na London a kpọrọ Maazị Kelechi Isiodu gwara BBC Igbo n'ekwenti na ihe nke a bụ ihe nwute. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Ụmụ ntorobia ruru itoolu Naijiria nwuru na London Abike Dabiri-Erewa na-agwa ndị Naịjiria bi London ha tee nkwucha, ọ degara ụlọọrụ ndị mba Britain akwụkwọ sị ha mee nyocha zuruoke. Onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ Kayode Ogundamisi bị kwa na London gwara BBC Igbo na ihe gọọmentị Naịjiria na-eme ezụghị. Ọ sị ""ụlọọrụ mba ndị isi ojii ndị ọzọ dị na London jisike na-enwe nzụkọ ka ha mara etu a ga-esi nyere ezinaụlọ ndị ahụ aka mana ọ nweghị ihe Naijiria na-eme"" Ogundamisi sị na ọ bụ oke ubịam na e dunye ụmụaka n'ụdị ndụ a ị bido rewe ọgwụ ike maọbụ banye otu ọjọọ dị icheiche. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49169137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49169137,Islamic Movement of Nigeria : Ihe itoolu e ji ama otu ndị oyiegwu,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na gọọmenti etiti amachiela otu ndị na-ekpe Alakụba a kpọrọ Islamic Movement in Nigeria (IMN) nke onye ndu ha bụ Ibraheem El-Zakzaky kpọmkwem.,"Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu, onye kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere n'Abuja ụbọchị Tuzde. Adamu kwuru na ndị uweojii ga na-ahụtazị otu Shi'ite dịka ndị oyiegwu dịka ụlọikpe siri kpebie. Cheta na ụbọchị Fraide Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke ọkpaikpe Nkeonye Maha nọ n'isi ya nyere mkpebi n'akwụkwọ nke gọọmenti etitu gbara machiri otu IMN dịka 'otu na-eyi ndụ egwu.' Mana ndi ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa na-ekwu na mmachi a machiri ndị Shia agbasoghị usoro ọchịchị onyekwuouche ya. Uzoma Anyakora, onyeisi ụlọọrụ 'Spider Security' kwuru na ""gọọmenti soro bute ọgbaghara ndị Shia ebe ụlọikpe nyere iwu ka a hapụ onyeis ha, ha jụụ ịhapụ ya."" Amnesty International katọrọ mmachị ahụ si na o megidere ikike ịgbakọ nakwa nke mmadụ ikpere chi masiri ya nakwa. Lee njirimara otu oyiegwu Lee ihe ndị ị ọ ga-abụ ịhụ ị mara na otu bụ ndị oyiegwu, dịka otu UNOC siri kọwaa 1. Ha na-akpa mkpamkpa dịka ogbugbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ,isunye mmadụ maọbụ akụnaụba ọkụ na mpụ ndị ọzọ yiri ha 2. Ha na-achọ ime ka ọha na-atụ ha egwu 3. Ha manye gọọmenti ka ha mee maọbụ hapụ ime ihe Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu N'otu aka ahụ, Anyakọra kwuru na njirimara ndị oyiegwu 4. Ha bụ otu na achọ mkpa nke onwe ha., ha anaghị achọ ọdịmma ọha 5. Ha bụ ndị ogbuaraọbara, ha na-achọ ịna-akwafu ọbara 6. Ha amaghị Chukwu nke ha naenwe obi mmadụ 7. E nyeghị ihe ha na-akpa ha, ha achọ igbu mmadụ 8. Ha na-enweta nkwado site na ndị mmadụ maọbụ mba ndị ọzọ 9. Mkpamkpa ha na-eme ndị mmadụ anaghị enwe ịkpe aga ebe ndị ha chọrọ ịga. Akụkọ ga-amasị gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" afirika-49591234,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49591234,Rochas Okorocha: Ihe mere anyị ji kpachitụ akụnaụba ya - Ọnụ na-ekwuru EFCC n'ọwụwa anyanwụ,Chris Oluka bụ ọnụ na-ekwuru EFCC na mpaghara ọwụ wanyanwụ sị na ọ bụ ka Sịnetọ Rochas ghara ire akụnaụba ya ndị a na-enyocha mere ha ji nata ikike ịkpachịtụ ha.,"Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ekwentị, Maazi Oluka sị na mkpachi akụnaụba ndị a bụ naanị nwa obere oge ka ụlọọrụ ha nwee ohere nyocha ha nke ọma. Ọ sị na ọ bụrụ na ụlọikpe sị na aka Rochas dị ọcha na ha ga-ahapụrụ ya akụnaụba ndị a mana ọ bụrụ na ikpe maa ya, na ha ga-ewere akụnaụba ndị a nyefe n'aka gọọmentị etiti. Oluka kwuru na akụnaụba ha kpachiri gụnyere ọtụtụ ụlọ obibi a na-akpọ 'Estate' na Bekee nakwa ụlọọgwụ nke a sị na ọ bụ nke Pascal Obi rụrụ ya ọrụ mgbe ọ bụ gọvanọ Imo Steeti. Ọ gara n'ihu kwuo na nke a apụtaghị na ọrụ ga-akwụsị n'ụlọọrụ ndị ahụ a kpachiri. Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru Sịnetọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo, ọ sị na Okorochas anọghị nso itinye ọnụ n'okwu ahụ. O kwuru na onweghi ikike itinye ọnụ ya ma ọ bụrụ na nna ya ukwu Okorocha enyeghi ya ikike ime nke a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45186255,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45186255,Regina Pacis Onitsha: Ụlọakwụkwọ ahụ bụzị ebe a na-agba nkiri.,"Mgbe BBC Igbo rutere na ya bụ ụlọ akwụkwọ ndị ụka katọlịk dị na n'onitsha, ụmụakwụkwọ juru ebe ahụ na-agụkwa akwụkwọ a na-achịkọba oge ezumike.","Ụmụ akwụkwọ nwaanyị ise a mere ihe nyere ndị nkụzị aṅụrị Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ bụ maazị Ken Nwoye kọwara na obi dị ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ niile ụtọ maka nturu ugo umu aka ise ahụ. End of Twitter post, 1 Nwoye kọwara na ụmụ aka ụmụnwaanyị ise ahụ nọ n'agbata afọ iri na atọ nakwa iri na ise, ma nọrọkwa na klaasị SS1. O kwuru na ụmụaka ahụ rụpụtara akụrụngwa ahụ, a na-akpọ 'FD Detector' ma ọ bụ ""Fake drug Detector' n'olu Bekee. Ndị mmadụ na-aga nleta ụlọakwụkwọ Regina Pacis kamgbe ihe ọṅụ mechara Nke a pụtara na akụrụngwa ahụ pụrụ igbochi mkpamkpa ọgwụ adịgboroja na-akpa na Naijịria. O kwuru na ya bụ FD detector bụ nke ndị ụlọ orụ NAFDAC nabatagoro. Ụmụ Regina Pacis na ndị nkụzị ha Ndị ya na Regina Pacis zọrọ ya bụ asọmpi bụ ụlọakwụkwọ si mba 115 n'uwa niile bịa, ha tukwara ugo dịka ndị mbụ. Aha ya bụ asọ mpi bụ World Technovation Challenge nke e mere na San Francisco na US. Ụmụaka turu ugo a bụ, Promise Nnalue, Jessica Osita, Nwabuaku Ossai, Adaeze Onuigbo na Vivian Okoye. Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onicha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018 Iji kwanyere ụmụaka ahụ ugwu, onye commisioner na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Anambara steeti kwuru na ya ga na-eyị uwe akwụkwọ Regina Pacis aga ọrụ ruo otu ọnwa. O bidoro nkwa a o kwere site n'iyi ya bụ uwe gaa ọrụ ụnyaahụ. Okammuta Kate Azuka kwuru na ya ga-eyị uwe ụlọakwụkwọ ahụ otu ọnwa Onyeisiala ụlọakwụkwọ ahụ ụkọchukwu Fada Vincent Ezeaka ka dukwa ya bụ ụmụ aka nọrọ na mba Amerịka ebe ha na -kwadozị ịlọtawa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43352921,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43352921,Ihe mberede Okporo ụzọ eriela ndụ mmadụ atọ na Lagos,Mberede okporo ụzọ mere na Lekki taa eriela isi mmadu atọ ma merụo ndị ọzọ ahụ.,"Ihe ruru mmadụ iri merụrụ ahụ tụpụ atọ anwụọ Akụko si ebe ihe mere na-apụta na-akọwa na ihe mere na ebe a na-atụ ụgwọ isi ụgbọala a na-akpọ ""toll gate"" n'olu Bekee. Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na otu ụgbọala nke a na-akpọ ""Jeep"" kụrụ ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ were merụọ ihe rụrụ mmadụ iri ahụ. Ndị ụlọọrụ ebe ""toll gate"" ahụ kwuru na ""jeep"" ahụ na-agba n'ụzọ o kwesighi mgbe ọ kụrụ ụbọala nke ọzọ ahụ. E buru ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị ịcheịche na Gbagada ma na Marina dị nso ebe ahụ Lee ihe onyonyo mmadụ nọ ebe ahụ setere: Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ na Marina kwuru na otu onye nwuru ebe mmadụ abụọ ndị nọ gbagada nwụrụ. Ndịọzọ ruru mmadụ asaa na-alụ ọgụ ndụ na ọnwụ n'ụlọọgwụ Marina ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48865191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48865191,"Klint Da Drunk: E nweta Biafra, ọ ga-adị mma","Maazị Afamefuna Klint Igwemba eji 'Klint da Drunk' mara bịara sonyere BBC Igbo n'atụmatụ mkparịtaụka a kpọrọ ""Gịnị na-afịọ"" nke abalị ise nke ọnwa Julaị.","Content is not available End of Facebook post, 1 Igwemba tinyere ọnụ n'ihe banyere Biafra, ebe ọ sị na atụmatụ Igbo-enwe-eze nwereike ibute nsogbu ma e nwete Biafra - ma sịkwa na ihe a bu ihe ga adị mma ""maka nwereonwe."" Ọ sị na ọ ga-adị mma ma Igbo nweta Biafra. Mana ọ rụtụrụ aka na e nwetachaa Biafra, ọ bụrụ sọ Ndigbo ebe ahụ ka ndị kwe na ndị ekweghị ka ejuputa. Klint da Drunk gwakwara BBC Igbo na ọ bụ egwu ka ya chọrọ ịgụ mana otu ụbọchi ọ gara ịgụ egwu e were si ya nye mmadụ abụọ bịara ọhụrụ ka ha gụọ egwu. Ọ sịrị na ""Dịka onye na-achọ ọganihu ndị mmadụ, m sị ha gaa n'ihu. Ka ndị mepee ọnụ nsogbu dị. ""Ụbọchi ahụ ka m sị na agaghị m agụ egwu ọzọ. Ndị a bụ ndị e ji 2face na Blackface mara ugbua."" Igwemba sị na ya lelechara anya cheta onye na-akpa ọchị ọ ma mgbe ọ na-eto a na-akpọ ""Scatta Moojo"" wee banye ime ihe ọchị. Gee ihe o kwuru n'uju n'elu:" afirika-49646030,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49646030,FBI & EFCC List: Anyị anwuchiela ndị 'yahoo' 167 na Naijirịa,Ndị uweojii nyocha nke mba Amerịka bụ 'Federal Bureau of Investigation na nke Naijirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nwere ọgbakọ na Legọs n'ụbochi Tọzde ebe ha gwara ndị ntaakụkọ etu ọrụ sị aga,"Ngalaba abụọ a kwuru na ha ga-etikọ aka ọnụ were megide mpụ na ohi nke Ịntanetị na nke igwe kọmputa. Onye ọrụ FBI gwara ndi ntaakụkọ na ha nwetere mkpesa ruru Puku iri abụọ (20,000) maka ohi nke akụ na ụba sitere n'Email nke napụrụ ndị mmadụ ego ruru otu ijeri naira na ọma ($1.2B). He gwara ndi ntaakuko na ha anwuchiela ụfodu n'ime ndi so na aha iri asaa na asaa (77) ndị FBI depụtara n'ọnwa gara aga. Dika ha siri kwuo, a ga-ekpe ụfọdụ ndị Naijiria a nwuchiri ma ndi nke so na aha mmadụ (77) FBI depụtara ikpe na mba Amerika. Ha gwara ndị ntaakuko na ha anwuchiela mmadụ 167 bụ ụmu Naijiria maka ihe gbasara mpụ a. Ha mekwara ka ndị ntaakuko ghọta na ha anapụtala ndị a nde naịra iri itoolu na abụo (N92m). Orji Uzo Kalu Orji Uzor Kalu Aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu agwala ndị nkwado ya ka ha ghara inwe obi abụọ gbasara nkagbu ụlọikpe kagburu mmeri ntuliaka ya. Cheta na ụlọikpe nta maka ntuliaka nọrọ ụnyaahụ kagbuo mmeri Kalu meriri Mao Ohabunwa na ntuliaka e mere n'ọnwa Maach afọ a. Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka INEC hazigharịa ntuliaka na wọdụ olemole n'ime abalị iri itoolu na-abịa abịa. N'ozi si n'aka ụlọọrụ ntaakụkọ ya, Kalu kwuru na mkpebi ụlọikpe ahụ anaghị echu ya ụra ma ncha. O kwuru na ya ga-emeri Ohuabunwa mgbe ọbụla emegharịrị ya bụ ntuliaka. N'okwu ya, ""A ga m agbagha mkpebi 'tribunal' ahụ."" ""Ohuabunwa abụghị onye a ma ama. E meriri m ya nke ọma."" ""APC ga-emerị PDP n'Abia North mgbe ọbụla a yiri ntuliaka a ọzọ."" N'ụbọchị Mọnde, otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC kọwara na onweghi mgbe ụlọikpe ji chụtuo Orji Uzor Kalu dịka onyeiwu kama ha sị na a ga-emegharị ya bụ ntuliaka. Agaghị enyeghachị Diezani Alison Ola ya Ola ya na ekentị olaedo ya alala n'ihi Ụlọikpe kachasi elu na Naịjiria enyela iwu na agaghi enyehachi Diezani Alison Madueke ola mma ya na ekwentị Iphone nke eji Olaedo rụọ ha nwetere n'ụlo ya. Onye Okaikpe bụ Nicholas Nicholas kwuru na Diezani na onye Okaiwu ya egosighị ihe mere a ga-eji nyehachi ya ihe ndia ha machiri. Busola Dakolo Biodun Fatoyinbo na Busola Daokolo Busola Dakolo, ekwuola na onweghi mgbe o ji kwuo ka ụkọchụkwụ Biodun Fatoyinbo kwụọ ya nde naịra iri n'ihi mwakpo ọ wakporo ya mgbe gara aga. Cheta na Dakolo gbara Fatoyinbo akwụkwọ na-arịọ ụlọikpe ka ha manye Fatoyinbo ka ọ rịọọ ya mgbaghara maka iwakpo ya mgbe orubeghi ihe e ji nwannyi eme. Ikpe ahụ ga-adị n'ụlọ ikpe nke ""Federal Capital Territory"". Ndị ọkaiwu Busola kọwara na nde naira iri ahụ ha chọrọ ka Fatoyinbo kwụọ bụ maka ego ha ji gbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe. Onwebeghi ọkaikpe e wepụtara ga-ekpe ya bụ ikpe. Rwanda egosila ihunanya Ọ bụ n'izuuka na-abịa ka a Rwanda ga-ebido ikpọrọ ndị a tọro na Libya Ndị Mba Rwanda ekwtela inabata ihe ruru mmadụ nari ise ndị tọrọ atọ na Libya. Ndi Rwanda kwetere inabata ndịa gunyere ụmụaka na ntorobia dịka ndi CNN gosiri ebe a na ere ndị mmadụ dịka ndi ọrụ na mba Libya. Nọt Korịa na Amerika ekpeziwela Donald Trump na Kim Jong Un N'ofesi, Mba Nọt Korịa ekwuola na ha dị njikere ka ha na mba Amerịka malitekwa mkparịtaụka etu a ga-esi kwụsị nchọpụta gbasara ịmepụta ogbunigwe nuklịa. Onye mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba ahụ na mba ndị ọzọ bụ Choe Son-hui kwuru na mkparịtaụka nwere ike ịmalite tupu ọnwa Septemba agwụ ma ọ bụrụ na Amerịka chọọ. Super Eagles na Yukren ga-achịpụ ya Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles oge ha mechara nkwado na Yukreb n'ụbọchị Mondee N'egwuregwu, otu Super Eagles nke Naịjirịa ga-ezute ndị mba Ukren n'asọmpi enyi na enyi na mgbede taa. Asọmpi a ga-ebiri ọkụ ma o jiri ọkara gafee elekere asaa nke uhuruchi. Asisat Oshoala Asisat Oshoala so na mmadụ iri na asatọ ahọpụtara ga-agbara Barcelona na asọmpị UEFA Nwaada Naijiria bụ Asisat Oshoala na agbara ndị otu bọọlu Barceleona ga-eso gba asọmpi ha na ndị otu egwu bọọlu Juventus na agba nke iri atọ na abụọ na asọmpi UEFA nke ụmunwanyị. Oshoala nyere goolụ asatọ n'ime asọmpị iri na otu na afọ egwuregwu gaara aga na otu egwu bọọlu Barcelona. Akụkọ ndị ọzọ ga-anasị gị: Gee Nkeji Akụkọ: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Nwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ" afirika-44777520,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44777520,Etu nwaanyị siri kwaa odibo ya mmiri ọkụ,Ụmụnwaanyị atọ agaala mkpọrọ na Pọtakọtụ(Port-Harcourt) dịka onye ọkaịkpe ukwu nụchara etu ha si emegbu ndị odibo ha.,"Nwaanyị nke mbụ jiri mmiri ọkụ etinyere ose kwaa n'ahụ nwata odibo ya dị afọ iri. Onye nke abụọ kwara nwata dị afọ iri na anọ ya na ya bi mmiri ọkụ, ebe nwaanyị nke atọ ji mma dị ọkụ ti nwata odibo ya ihe ma tinye kwa ya ose n'ike. Mgbe ụlọịkpe nụchara ịkpe a nke otu ụmụnwaanyị ndị okaiwụ bụ FIDA n'aha ịchafụ bugara ụlọịkpe na Rivas steeti, onye ọkaikpe ukwu ahụ ekpebie n'ụmụnwaanyị ahụ ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ rue mgbe a ga-anụ ihe gbasara okwu a ọzọ. Anthonia Osademe bụ onyeisioche otu ndị ọkaiwu ụmụnwaanyị nke a kpọrọ 'FIDA' nke Rivas steeti kwuru na uche ndị mmadụ ebidola ị ga n'ihe gbasara mmegbu odibo na ebe ha nwere ike ị ga mkpesa maka ya. O kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ ebidola ị bịa n'ụlọọrụ ha ma na-agakwa n'ụlọọrụ ndị uweojii ekpesa maka mmegbu ọbụla ha hụrụ. Osademe kọwara na ọ bụ ndịnkuzi na ndị agbataobi gwara ha bụ FIDA na ndị uweojii maka akụkọ ndị a. N'ọnụ ya, ""Na agbanyeghị na ụdị okwu a na-ebute nwute, ọ bụ ndị mmadụ dịka mụ na gị bịara kọrọ anyị akụkọ a. Ụmụaka ndị odibo nwere ikikere dịka ụmụaka ọzọ n'ala Naịjirịa.""" afirika-45322732,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45322732,BBC gbaara ndị Uburu Ohaozara akaebe mgbe ha riri ji ọhụrụ,"Ji bụ eze nri niile di n'ụwa, dịka Ndigbo siri kwekọrịta.","Iri ji ọhụrụ n'Adu Uburu Ya kpatara e jiri wepụtara ya ụbochị pụrụ iche. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo, ụbọchị e ji eri ji ọhụrụ bụ mbido afọ ọhụrụ ha. Otu a ka ọ dị n'Uburu Adu nke dị n'okpuru ọchịchị Ohozara n'Ebonyi steeti. Emume ji ọhụrụ nwere ọtụtụ aha n'Alaigbo. Ndị Uburu n'onwe ha na-akpọ ya 'iri ji ọvụ' nke pụtara 'iri ji ọhụrụ' maọbụ 'Isu Ava'. Ndị ọzo n'akpọ ya ikeji, iri ji ọhụrụ, ịhajiọkụ, iwa ji na ọtụtụ aha ndị ọzo dị iche iche. A na-eme emume iri ji n'Alaigbo kwa afọ site n'ọgọst ruo ọnwa septemba. Oge a bụ mgbe eji egwuputa ji ọhụrụ n'ala. Ji ohuru Ọ bụkwa ọge a ka eji akwusịlata ịgwupụta akụkụ n'ụgbọ n'Alaigbo bụrụ malite ọrụ ụgbọ ọzọ. Ejikwa mgbe dị otụ a ezurukwa ike ọrụ n'Alaigbo tụpụ amalịta ọrụ ọzọ. Onweghị onye ma ka ya bụ emụme siri bido n'Alaigbo, mana ihe anyị chọpụtara bụ na iri ji nwere ugwu pụrụ iche ndị Igbo n'akwaghere ya. Emụme na nganga sọ iri ji n'Alaigbo kariri akari nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-esi obodo dị iche iche lọtacha obodo ị bịa mee emume iri ji. Ndị enyị, ọgọ na ikwu na ibe na-abịa sọrọ irie ma ṅụkwa. Iri ji ohuru na Adu Uburu Nke ndị Uburu Ado mere mgbe ọnwa ọgọst dị mkpụrụ ụbọchị iri abụọ n'afọ a gọvanọ Dave Ụmahị na oriaku ya bịara ebe ahụ, iji gosi ka ya bụ emụme si dị mkpa. Gọv. Dave Umahi na ọrịakụ na Isu Ava Uburu N'otu aka ahụ, ndị Igbo niile nọ n'ofesi na-emekwa emụme iri ji. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo ọ bụ Eze obodo maọbụ Ezemụọ na-aka mgbe eji eri ji n'ime onwa ọgọst rue septemba. Iri ji ohuru n'Adu Uburu Onye kọọrọ BBC ka esi mee emume iri ji nke afọ a n'ụbụrụ bụ Ojukwu Innocent Ene sịrị n'ụburu, ọ bụ onye ọgụ ava (onye na-agụ afọ) na-aka mgbe oge iri ji ohụrụ ruru. Ọ bụ naanị ndị Ọgwụnta nke dị n'ime Uburu ka ọ bụ ọrụ ha ịgụ ya bụ ava (afọ). ""Ya bụ Ezemou na-eji ohere a kele Chukwu Abịama maka uju nri akọpụtara n'afọ ahụ, ọ kachasị ji"" , dịka Ene siri kwuo. Ọ kwụkwara na ""n'Alaigbo, ji bụ eze nri. Ya kpatara ojiri bụrụ arụ mmadụ itukwu n'elu ji"" agbanyeghị ka ugwu ejina onye ahụ. Ji ochie Ihe ndọhachị azụ dị n'emụme a bụ na ndị ọgbaraọhụrụ na-ahụtazị ememe iri ji dịka emụme arụsi. Mana Ene kwuru na n'ezie emume iri ji enweghị ihe gbasara ya na arụsị. ""Ọ bụ emụme eji ekele Chineke maka ji ọhụrụ nakwa afọ ọhụrụ, ma ị kọtara ya ma ị gotere n'ahịa"". Ọ bụrụ na ekelecha orisaebuluwa maka onyinye a, onye ọbụla amalite iri ji. Igwe Akpandu nke Uburu na-ekpe ekpere maka ji ọhụrụ Gịnị mere ji jiri bụrụ eze nri niile n'Alaigbo? Ji bụ eze nrị nịịle maka onweghị ihe dị na ji na-alaniyi. Esi ọtụtụ ụzọ eri ji. A na-esu ya na mmanụ. Gọv. Dave Umahi na-eri ji mbụ n'afọ A na-ete ya ete, sụkwa ya ka nri onuno. Eji ji eme ụrị n'ofe nke ga-eme ka ofe rọọ arọ. Isu ụtara ji Ya mere eji echị onye kachasị akọ ji na mba echịchị pụrụ iche. N'Ụbụrụ Adọ nakwa ebe ndị ọzọ, a na-etụ onye ahụ Osuji. Onwekwara ndị na-echị onye ahụ Di ji maọbụ Ezeji. N'Ikem, onye kọtara ji gbara mkpị abụọ maọbụ ji ogene dịka ha na-akpọ ya, a na-etu onye ahụ Ezeji. Dịka Ojukwu Ene siri gụpụtara anyị, ihe ndị a bụ ụrụ iri ji baara ndị Igbo. Uru emume iri ji baara ndị Igbo N'abalị ụbọchị a ga-eme emume iri ji, a na-ericha ji ochie nịịle iji nabata ji ọhụrụ. Gọv. Dave Umahi na Oriakụ n'emụme iri ji ndị Uburu Mgbe ahụ ji n'amalitekwa imebi, iji gosi na oge ya agaala. N'ụbụrụ Ado, dika na ebe ndị ọzọ, a na-eji emume dị iche iche anabata ji ọhụrụ. Ọ bụrụ na a gọcha ọfọ ya na ya sọ, nke onye Eze, ma ọ bụ Ezemụọ ga-eme, onye ọbụla amalite iri ji ọhụrụ. Onye ọbụna gọrọ ya bụ ọfọ ga eji mmanu nri erie ya bụ ji ohuru ahụ tupu ndị ọzọ amalite. Ụmụokorobịa bịara iri ji n'Uburu Ezinaụlọ ọbụla ga-eji ihe ha nwere rie ji ọhụrụ. Ụfọdụ na eji ọkụkọ, ebe ndị ọzọ na eji ewu. Ebe aka uru nwaanyị otukwasa dị ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54749054,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54749054,Oyigbo: 'Ụjọ ji anyị na ụmụ anyị kamgbe abalị atọ n'obodo a'- Onye bi n'Oyigbo,Oyigbo dị na Rivers Steeti bidoro wube na soshal media ọzọ taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Novemba 2020.,"Ndị mmadụ nọ na soshal midia na-ajụ ihe mere e ji gbachi nkịtị maka oke ogbugbu ka na-eme ebe ahụ. Nke a mere ka anyị kpọọ otu onye bi n'ogbe ka ọ gwa anyị nke na-eme ebe ahụ ugbua. Ejike Akomas kwuru na ha zoro n'ime ụlọ kemgbe abali atọ dịka ndị agha ezitere ka ha wegahchite udo n'Oyigbo na-akwa mgbọ iji hụ na ha wetere nchekwa n'ebe ahụ. O kwuru na mgbọ ahụ ndị agha na-akwa, na-enye ha na ụmụ ha nsogbu. Akomas kwuru na ndị kpara arụ a kpatara ndị agha ji wuchie iche ebe ahụ nche agbalagala mana ndị bi n'Oyigbo na-atazi ahụhụ ya. N'ọnụ ya, ""kemgbe abali atọ, anyị enwetebeghị ihe oriri maọbụ ọgwụ igwọ ọrịa na-arịa ụfọdụ ndị bee anyị maka mmachi e etinyere n'obodo anyị. Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na iwu mmachị ka na-aga n'ihu n'obodo Oyigbo, ndị uweojii na ndị agha ezigara ebe ahụ ka nọ ebe ahụ, ya enwetabeghị mkpesa maka nsogbu ọbụla si ebe ahụ apụta. Omoni kwuru na ọ bụrụ na a na-egbu ndị mmadụ dịka akụkọ si efegharị na soshal midia na a ga-enwe ozu ndị si na ya bụ ogbugbu pụta, ọ gara n'ihu kwuo na akụkọ ahụ nke ndị omekome ji etinye ụjọ n'obi ụmụ Naịjiria. O kwuru na Oyigbo juru oyi ugbua. Cheta na ọgbaghara si na ngaghariwe End SARS malite mere ka gọọmenti Rivers steeti tinye mmachị ngaghari na steeti ahụ ruo ugbua. EndSARS: Ihe mere ndị Ugwu ji gbahapụ Rivers steeti na obodo ndị gbara ya gburugburu Otu n'ime mpụtara ngagharịiwe End SARS bụ na ụfọdụ ndị Ugwu na-azụ ahịa na ndida Naijiria, agbahapụwala Rịvas steeti na obodo ndị gbara ya gburu gburu ọsọ n'ihi egwu. Ndị ojiegoachụ ego n'ime ha kpebikwara ịkwụsị ibute ngwanrị na mpaghara ahụ. Nke a na-abịa dịka ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Ugwu ebe ngwa ahịa ha nakwa ụgbọala ha ji ebu ahị so na ihe a gbara ọkụ na Rịvas steeti na steeti ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Onyeisi otu ACF ngalaba nke Rivas steeti bụ Usman Ibrahim Tudunwada ksịị, ""Ọtụtụ ndị be anyị, ọkachasị ndị e merụrụ ahụ (n'ọgbagharaEndSARs) bidoro na-alaghachi Ugwu n'ihi ihe mere."" 'Anyị ga-akwụsị ibute ngwa nri na Rivas' Usman Ibrahim, onyeisi Arewa Consultative Forum na Rivas steeti kwuru na e gburu ọtụtụ ndị otu ha n'ọgbaghara so EndSARS Na nsonso, otu 'Arewa Consultative Forum'(ACF), ngalaba nke Rivas steeti kwuru na ha ga-akwụsị ibute ihe oriri na Rịvas steeti nakwa mpaghara Ndịda Anyanwụ n'ihi ajọ agwa ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob kpasara ha na steeti ahụ n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS na steeti ahụ. Usman Ibrahim Tudunwada, onye bụ onyeisi otu ACF na Rivas steeti gwara BBC Igbo na ihe butere ya bụ mkpebi bụ na a gbaara ụgbọala gwongworo ha ji ebu ahịa nakwa ngwahia ha ọkụ ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha na n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS. ""Ndị Ipob gburu ndị otu anyị mmadụ iri"" "" Anyị nwere mmadụ iri ndị otu Ipob gburu. Anyị ka na-achọkwa ise, ebe mmadụ iri na abụọ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ."" Tudunwada na-arụ ndị otu Ipob aka dịka ndị kpara mkpamkpa ahụ dịka o kwuru na ndị mere ya bụ ihe ji ngwa e jirimara ndị Ipob. Ndị Ugwu gara ili onye nke ha nwụrụ na nsogbu EndSARS Ya mere o jiri were na-ajụ sị, ""Kedụ ihe anyị ga-eji na-ebutere ndị na-egbusisi anyị ma na-agba ngwahịa anyị ọkụ?"" Na nsonso a, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob wakporo ndị Ugwu na Oyigbo na Iriebe dị na Rivas, mebie ngwahịa ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ na Oyigbo na nsonso a. Dịka gọvanọ steeti ahụ bụ Nyesom Wike siri kwuo, ""Ipob gburu ndịagha isi, ndị uweojii anọ ma gbaa ogige ndị uweojii ọkụ,"" ma mebikwa ọtụtụ ihe ọha nakwa ndị nọrọ onwe ha nwe. Mana Wike enweghị ihe o kwuru maka ọnụọgụgụ ndị nkịtị gunyere ndị Ugwu e gburu n'a ọgbaghara ahụ. Kọmịsọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Paul Nsirim azaghị ekwenti ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị maka ebubo nke ndị Ugwu nọ na steeti ahụ na-ebo. N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni gwara BBC na ọ ga-akpọchị anyị inye ọsịsa na-ajụjụ ebubo ndị Ugwu e gburu. Ọzaghị ekwentị ya oge a kpọghachiri ya nke o ji asa ozi e zigara ya n'ekwentị. Mana otu Ipob na-agọ na aka ha adịghị na ihe e mebiri na Rivas steeti. Ọkaiwu otu ahụ bụ Aloy Ejimakor kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa mere ọgbaghara, na ọ bụghị otu Ipob. Ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakor sị, ""A na-ebochikarị ndị otu Ipob ọnụ."" ""A na-ebochikarị ndị otu Ipob ọnụ. Ebe ọbụla Onye Igbọ na onye Ugwu nwere nghọtahịe, asị na ọ bụ ndị Ipob."" Ọ gara n'ihu sị o kwesịrị ka ndị uweojii nyocha ya bụ ihe,o nwee onye ntọrọbịa mere mpụ, sị gbaso Iwu Naijiria were taa ya ahụhụ. N'okwu na ndị Ugwu ga-akwụsị ibute ngwanrị n'a Ndịda Naijiria, "" ọkwurụ na ọ bụụ na ndị Ugwu nwere obi one Naijiria Ka ọ dị ụgbua, e nwela ụkọ ụfọdụ ngwa nri a na-esi na Ugwu Naijiria ebute na Ndịda-Anyanwụ, ebe ọnụahịa ụfọdụ nri si Ugwu abịa dịka ịyabasị gbaliri elu n'ihi oke ụkọ. Ndị ụfọdụ ụmụnwaanyị kwụpụtara, alibasa a na-azụbu otu narị naira bụzị narị naira atọ maọbụ karịa. Ahịa alịbasa so n'ihe a gbara ọkụ na ọgbaghara ahụ. 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53042309,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53042309,WAEC New Date: Lee mgbe na etu a ga esi lele ule nke 2020,Ụlọọrụ West Africa Examination Council ekwuola na ha ga-elele ule West African Senior School Certificate Examination (WASSCE) nke afọ 2020.,"Patrick Areghan(Onyeisi WAEC) Ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ bụ Demianus Ojijeogu gwara BBC Igbo na mgbe ọbụla gọọmenti ji wepụ mmachị amachiri ụlọakwụkwọ nakwa mmachi nke isi steeti banye steeti ọzọ maka coronavirus, na ha ga-amalite ule WAEC. Mgbe anyị jụrụ ha nkwadobe ụmụakwụkwọ ga-ede ule a, Ojijeogu kwuru na ngalaba ha ga-enyekwu ụlọakwụkwọ dị iche iche ohere iji kwado ụmụakwụkwọ maka ule a. O kwuru na ihe kacha WAEC mkpa ugbua bụ ndụ na ahụike ụmụakwụkwọ. N'okwu ya, ""anyị ga-eso usoro ọbụla gọọmenti etiti wepụtara maka etu a ga-esi le ule a n'oge coronavirus."" Ihe na-echekasị nne na nna Mazi Okey Okere, nwa ya nọ na J.S.S 3 kwuru na agbanyeghị na nwa na-eji igwe intanet amụ akwụkwọ ugbua, na uche na-eche ya ma ọ dịla njikere ọfụma maka ile WAEC ma kanye ya ugbua. Ọ gara n'ihu gosi nwute ya gbasara nne na nna na-enweghị ike ịkwụnụ ụgwọ igwe intanet ka ha nwa ha wee mụta akwụkwọ. Okere kwuru na ọ ga-adị mma ka WAEC dọtịkwuo oge ha ga-enye ụlọakwụkwọ ka ha kwado ụmụakwụkwọ nọ na J.S.S 3 nakwa S.S 3 ọfụma. Ndị nwe ụlọakwụkwọ na-eti mkpu nke ha Nora Oguda bụ onyeisi ụlọakwụkwọ kwuru na kamgbe 'Lockdown' coronavirus butere, ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị ohere iji intanet mụọ akwụkwọ maka ọgbatauhie so ya bia. Oguda kwukwara na egwuregwu akpakọrọla uche ọtụtụ ụmụakwụkwọ ga-elele ule a nke mere na ọ ga-adị mma ka enyetukwuo ndị nkuzi ohere ma ewepụ mmachị ka ha kwado ụmụakwụkwọ ọfụma. Otu nwata akwụkwọ anyị kpọrọ n'ekwenti kwuru na o chere na ya dị njikere ile WAEC site n'ihe mmụta ọ na-anata n'intaneti. Cheta gọọmenti etiti machịrị ọgbakọ n'ụlọakwụkwọ kamgbe ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43875993,https://www.bbc.com/igbo/43875993,Gịnị mere akwụkwọ eji amaonye ndị Naịjirịa?,Iwu pụtara n'afọ 2007 kwuru na onye Naịjiria dị afọ iri na isii were gawa ga-enwe akwụkwọ njiamaonye.,"NIMC kwuru na ugbua sọọsọ ndị dere aha n'afọ 2012 na 2013 bụ ndị a ga-enye akwụkwọ eji amaonye Maka ihe a, gọọmentị etiti mapụtara ngalaaba a kpọrọ National Identity Card Commision na bekee, maka ihu na onye ọbụla bụ nwaafọ Naịjiria nwere akwụkwọ njiamaonye a. Mana kemgbe e wepụtara ụlọọrụ a, ọtụtụ ndị Naịjirịa enwebeghị akwụkwọ a. Mgbọ nịịle BBC mere ịkpọ ụlọọrụ amịpụtaghị mkpụrụ makana akara ha anaghị agaaga. Ihe ndị Naijirịa na-ekwu Gịnị mere na ọbụghị onye ọbụla ga-enwe akwụkwọ a BBC Igbo na ụfọdụ ndị Naịjirịa nwere mparịta uka, ha gwara anyị ihe agabigara oge a na-achọ ị nweta akwụkwọ eji amaonye a. Bridget Chigbufue biri na Lagos gwara anyi na ya ata ezigbo ahụhụ. O kwuru na: ""Mgbe m dere aha m, n'akwụkwọ a, a gwara m, na o ga-eru ọnwa abụọ, mana o ruola afọ ise enwebeghị m akwụkwọ a"" Oluchi Okwuone biri na Bini kwuru na ha enwebeghị ọtụtụ ụlọọrụ National Identity Card Commision na steetị ha. N'ọnụ okwu ya: ""Oge ọbụla ị bịara ụlọọrụ ha, ị ga-ahụ ọtụtụ mmadụ ka nkụ, ihe a na-bọọ ụme."" Nnamdi Ojiego biri na Owerri gwara anyị na mpụ na aghụghọ ebieela omume a. O kwuru na: ""ọtụtụ n'ime ndị a, na-echọ onye ga-enye ha ego"" O kwukwara na enweghị ọkụ bụ ihe ọzọ na-ebute nsogbu na ọrụ a. Ojiego kwuru na: ""ọtụtụ oge ị bịara ebe a, anaghị enwe ọkụ, ịhea na-eme ka ị denye aha n'akwụkwọ anaghị aga ọsịsọ."" Isi ruo ọdụ n'akụkọ akwụkwọ eji amaonye a Ọ bụ na n'afọ 1977 ka echiche ị mụpụta akwụkwọ eji amaonye buru isi bata n'obi gọọmentị. N'afọ 2003, ụlọọrụ akporo National Civic Registration na bekee bidoro ị debe aha mmadụ n'akwụkw. Ha kwuru n'oge ahụ a dere aha mmadụ nde 54. Mana ebubo mpu na aghụghọ mebi omume a. Ọ bụ n'afọ 2010, ka ngalaaba ọhụrụ a akpọrọ National Identity Card Commision bidoro ọrụ nke ha. Onye na onye derela aha ha n'akwụkwọ a Ugbua, dịka ozi NIMC wepụtara n'ọnwa Maachị 2018 si kwu, e debanyela aha mmadụ nde iri atọ n'akwụkwọ njiamaonye. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48046575,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48046575,Wolves vs Arsenal: Wolves arachala Arsenal ka ofe nkupu,Arsenal ahụghị bọọlụ gbaa taa dịka Wolves napụrụha ha ụkwụ site n'ịsụnye ha ọkpụ goolu atọ asatara naanị otu.,"Wolves malitere ịkaji Arsenal nku na nkeji 28 mgbe Ruben Neves ji ""Free kick"" nye goolu mbụ ha. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu ndị Wolves nwetere bọọlụ n'akụkụ bụ nke Matt Doherty ji isii ya makpuo n'ime neetị na nkeji 37. N'iji pịa Arsenal ụtalị, Diogo Jota nke Wolves ji oke ọsọ kpaa ndị otu Arsenal abụọ ma si n'okpuru aka oche goolu ndị Arsenal bụ Leno wụnye goolu ọzọ na nkeji 45. N'ihe karịrị ọkara n'ime agba nke abụọ, ndị otu abụọ a kwechiri rue na nkeji 80 mgbe Sokratis Papastathopoulus nyere goolu nkasi obi ndị Arsenal. Arsenal gbọrọ ụja niile ha nwereike mana Wolves gwara ha na obighi n'ịgbọ ụja ma were ọkpụ atọ asatara otu merie ha. Mmeri a ndị Wolves meriri Arsenal bụ mbụ ha na-emeri ha kamgbe afọ 1979. Dịka ọ dị ugbua Arsenal ji ọnụọgụgụ 66 nọrọ na ndị ise n'ogogo tebụlụ Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Kedu ebe Igbo si?" afirika-47916457,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47916457,AFCON 2019 Draw: Burundi na Madagascar bụ elelia nwaite - Gernot Rohr,Onye nkụzị ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu ya ga-akpachapụ anya n'izute ndị egwu bọọlụ Burundi nakwa Madagascar.,"Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Nke a bụ mbụ ndị mba abụọ a na-etozu iso gbaa asọmpi a kemgbe ọ malitere na-afọ 1957. Rohr sị na ""ọ dị mma ihu ụdị uchu na obiike mba abụọ ga-ewebeta n'egwuruegwu a"". Ọ kwukwara na ya ma Madagascar nke ọ ma ""maka nwunye ya bụ onye mba ahụ"". Rohr tokwara Burundi ka ha sị merie Gabon mgbe a na-azọ onye ga-etozu ịpụta n'ọgbọ a. Ọ sị na ya n'atụ anya izute ndị otu egwu bọọlụ siri ike dị ka Senegal and Ghana n'asọmpi enyi na enyi tupu amalite ịsọmpị African Championship n'onwe ya. Rohr kwara BBC nke a ụnyahụ mgbe a tụchara nchọ AFCON na Egypt. Naịjirịa dabanyere n'ime otu nke a kpọrọ ""group B"", bụ ebe ha na mba Guinea, Madagascar na Burundi ga-esukọta mpi. Kedụ ihe o ji dị ka ha alaferela? Nke a bụ mbụ mba Burundi na-abịa asọmpi Iko mba Afrịka kemgbe e ji hibe ya n'afọ 1957. Mba Egypt bụ ndị ga-ele mba ndị ọzọ ọbịa n'asọmpi a, ga-ezute DR Congo, Uganda na Zimbabwe n'otu A. Ndị ga-ezute ibe: Ndị ọzọ ga-ezute onwe ha mezuru ya mba 24 ga-eso zọọ asọmpi a. Otu C Senegal Algeria Kenya Tanzania Otu D Morocco Cote D'Ivoire South Africa Namibia Otu E Tunisia Mali Mauritania Angola Otu F Cameroon Ghana Benin Guinea-Bissau Ndị burula iko a na ugboro ole ha burula ya: Kemgbe ahụ otu a ka esi buo iko a: Egypt: ugboro asaa: (1957, 1959, 1986, 1998, 2006, 2008, 2010) Cameroon: ugboro ise (1984, 1988, 2000, 2002, 2017) Ghana: ugboro anọ: (1963, 1965, 1978, 1982) Nigeria: ugboro atọ (1980, 1994, 2013) Ivory Coast: ugboro abụọ (1992, 2015) DR Congo¶ ugboro abụọ (1968, 1974) Zambia: otu ugboro (2012) Tunisia: otu ugboro (2004) Sudan: otu ugboro (1970) Algeria: otu ugboro (1990) Ethiopia: otu ugboro (1962) Morocco: otu ugboro (1976) South Africa: otu ugboro (1996) Congo: otu ugboro (1972) Akụkọ ga-amasị gị" mba-uba-44782249,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44782249,Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụmụaka iri na abụọ nakwa onye nchịkọta ha apụtala nime ọgba ahụ na mba Thailand.,"Ndị ọrụ Navy Seal du ọrụ mgbapụta a, kwuru na a kpọpụtachaala ụmụaka 12 a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba kemgbe izu abụọ. N'ihe ha dere na Facebook, ha kwuru sị ""ụmụaka 12 a e ji 'wild boars' mara na onye nchịkọta ha apụtala n'ime ọgba. Ahụ zuru onye ọbụla oke. Hooyah."" A kpọpụtara ụmụaka asatọ ụnyaahụ, ma kpọpụta ụmụaka anọ, onye nchịkọta ha na otu dọkịta gara inyere ha aka taa. Cheta na ụmụaka a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba ụbọchị Juun 23. Ihe ndị mmadụ na-ekwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekeleela ndị nyere aka ịkpọpụta ụmụaka a. Ndị otu Manchester United kwuru sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha ma ha gbakee. Ị ga-ahụ ụmụntakịrị ahụ ebe ha na-agwa onye na-egwu mmiri aha ha" afirika-54853262,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54853262,Foot Ailments: Lee ọrịa ụkwụ ndị a na etu ị ga-esi gwọ ha,Akụkụ ahụ niile dị mkpa mana o nwere ndị ka ibe ya mkpa.,"Iji maatụ ụkwụ mmadụ - ọ bụ ụkwụ mmadụ bụ na mmadụ na-akwụ ọtọ, na-aga ije, agba ọsọ, akpata ego ndz. Ugbua anyị ga-elebanye anya n'ọtụtụ ọrịa na-enye ụkwụ mmadụ nsogbu na etu ị ga-esi gbalahụ ya. Ụfọdụ nwereike ịnwe ọrịa a mana ha agaghị a ma ya mana lee ihe otu dọkịta bụ Obinna Obuka gwara anyị maka ya. Ihe ọzọ pụtara na ya bụ okwu bụ na ụdịrị akpụụkwụ mmadụ na-eyi, ọ kachasị ụmụ nwaanyị na-eso akpata ọrịa n'ụkwụ. Lee ụfọdụ ọrịa ahụ ebe a: 1.Mgbawara ụkwụ Ọrịa a bụ nke Bekee kpọrọ 'Athelete's foot' dịka dọkịta Obinna si kọwaa bụ ọrịa nje akpọrọ 'Fungi' na-ebute. ""Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ naanị n'etiti mkpịsị ụkwụ ka ọrịa a na-apụta mana ọ bụghị eziokwu"" ka o kwuru. ""O nwereike ị pụta ebe ọ bụla n'ụkwụ mmadụ ma na-emetụkarị ndị ime ahụ ha esighi ike"". O kwuru na ụzọ a ga-esi gwọ ya bụ iji ""Clotrimazole na ketoconazole"". 2. Ọtịtọ mkpịsị ụkwụ bụ ""Corn"" Webụsaịt NHS bụ ngalaba ahụike nke mba Ingland kọwara ọrịa a dịka ""akpụkpa ahụ gbara ọkpụrụkpụ siri ike"" Ha kọwara na o nwereike ọ gaghị afụ ụfụ mana ọ dị mma ịtinye anya ebe ọ nọ. Ihe kachasị ebute ya bụ ọrịa bụ mmadụ ịyi akpụkpụ ụkwụ abaghị onye ahụ maọbụ na-afụ ụfụ. Ihe ndị ị ga-eme ị kwụsị ya gụnyere: 3. Akpụrụ ụkwụ bụ 'Bunions' Akpụrụ na-eme mmadụ n'ụkwụ mgbe otito nwere ọkpụkpụ n'ime ya na-eto n'akụkụ mkpịsị ụkwụ kachasị ma mee ya ka ọ gbagọọ. O nwereike ị na-acha ọbara ọbara ma na-afụ ezigbo ụfụ. Ọ bụkwa ọrịa ọzọ na-abịa site n'iyi akpụkwụ anaghị gị. Ihe ndị ọzọ na-ebute ya bụ akpola, agbụrụ mmadụ nakwa ọrịa mgbujiri na-eme na njiko ọkpụkpụ. Uzo e si agwọ ya bụ iyi akpụkpụ ụkwụ bara gị ọfụma. ịnụ ọgwụ na-akwụsị mgbu. Dọkịta Obinna kwukwara na ""ị nwereike waa ahụ maọbụrụ na mgbu karịa n'ụkwụ ahụ"". Gịnị na-ebutekarị ọrịa ndị a? Dọkịta Obinna kọwara na ọtụtụ ọrịa ndị a si n'ụdịrị akpụkpụ ụkwụ ndị mmadụ na-eyi ""Ọkwa ị ma na ihe ndị a bụ mmadụ ị na-afanye ụkwụ ebe ọ baghị na-ebute ha"" ka o kwuru." 42971173,https://www.bbc.com/igbo/42971173,Anyị anụghị mgbe Ortom sị ndị mmadụ che ndụ ha,Ndị uweojii na Benue steetị si na ha agaghị sa okwu Govanọ na-achị Benue steetị bụ Samuel Ortom kwuru banyere ogbu mmadụ na-esote ọgbaghara ndị ọkọugbo na ndị ọchị ehi ebe ahụ.,"Ortom na Buhari nwere ọgbakọ n'ọnwa gara aga. Ndị ntaakụkọ di icheiche na Naịjirịa na-akọ na Ortom, na ebe o na-ekwuokwu na radio na Makọdị ụnyahụ, si ndị mmadụ ha chọwa etu ha ga eji zọ ndu ha ma ha na ndị ogbu mmadụ zukọ. Mana BBC jụru onyeisi ndị uweojii na steetị ahu bụ Fatai Owoseni ihe ha hụru n'okwu a a na-asị na Ortom kwuru, o wee si na ya enweghi ike itinye ọnụ na okwu a maka ọnụghi ihe Ortom kwuru. Onye na ekwuchitere Ortom bụ Tever Akase kwenyere na ihe Oweseni kwuru ka o sị na ya amaghi maka okwu a sị Ortom kwuru. Tever gara na ilu wee kọwa na ma ruo ugbua, a na egbu mmadu na ime obodo na steeti ahụ. BBC jụrụ ha maka okwu onye na-ekwuchitere uweojii na Naịjirịa kwuru maka Ortom ụnyahụ mgbe ọ gara isa ajụjụ na Channels TV, o wee si na ndị uweojii kwesiri ịkọwa ihe ha na-eche wee kwuo ụdịrị okwu a. Ọ sikwa na ya amaghịzi ma gọvano ya o onwekwara nchekwa na steetị ahụ. BBC gbara mbọ inwete onye na ekwuchitere uweojii Jimoh Moshood. Anyị na-ele akụkọ a anya, ọzị ọzọ pụta, anyi ga-ewetara ụnu ya. Mana, na social media ndị madu na-ata Jimoh Moshood ụta maka ihe okwuru na Channels TV Ndị ome iwu nta nke Naịjirịa tinyekwara ọnụ wee si ka a chụọ Jimoh Moshood na ọrụ. Akụkọ ọzọ social media bu bụ na Gọvanọ Rivers steetị bu Nyesom Wike jere ikenne Ortom maka ndị a sị na ọchụ ehi gburu n'obodo ahụ." afirika-43368569,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43368569,Ụmụ Sir Louis Ojukwu nọ n'ụlọikpe maka akụnaụba ya,Esemokwu na-ada n'ime ezinaụlọ Sir Louis Odumegwu Ojukwu ewelitela isi ọzọ.,"Ụmụnne Ojukwu na nwunye ya gara ụlọikpe maka akụnaụba nna ha Ụnyaahụ bụ Orie, n'ụlọ ikpe Ọka, nke dị n'Anambra Steetị ka ya bụ ikpe bidoro n'afọ 2014 malitere ọzọ. Ikpe ahụ nke Okaikpe Dennis Mmaduechesi nọ n'isi ya gosiri na ụmụnne Dim Odumegwu Ojukwu na-azọ akụnaụba nna ha bụ Sir Louis Odumegwu Ojukwu. Ikemefuna Ojukwu na Chukwuma Ojukwu bụ ụmụnne Dim Chukwuema Ojukwu kpụpụrụ nwanne nna ha bụ Joseph Ojukwu, Ike Ojukwu, Lotana Ojukwu nakwa Bianca Ojukwu bụ nwunye Dim Odumegwu Ojukwu ụlọikpe. Gịnị ka Ikemefuna na Chukwuma na-azọ? Ha na-arịọ ụlọikpe ka e kenye ha pasentị iri abụọ na ise (25%) n'ụlọ nna ha dị na 73 owerri road, Nnewi. Ha na arịọkwa ụlọikpe ahụ ka e kenye ha pasentị iri abụọ na ise (25%) nke ụlọọrụ ụgboala nna ha bụ Ojukwu Transport Company. Ọtụtụ ndị Igbo anaghị ekwe ede akwụkwọ maka ịke akụnaụba (will) ha mgbe ha dị ndụ Ha rịọrọ ụlọikpe ka e mee ka ndị ahụ eboro ebubo bịa kọwaa ka ha na akụnaụba nna ha siri gaa kamgbe ọ nwụrụ. Ọ bụkwa mkpesa ha kpesara ụlọikpe ahụ mere ka ndị ahụ wepụta akwụkwọ nna ha jiri kee akụnaụba ya tụpụ ọnwụọ. Akụkọ kwuru na ndị nọchitere anya Joeseph bụ Okwuchukwu Ugolo (SAN), ebe Ebuka Ogwu na Christopher Ezeoka nọchitere anya Lotanna Ojukwu nakwa Ojukwu Transport Company. Dịka ihe siri gaa unyaahụ, o doro anya na ndị biara ya bụ ikpe akwadochaghị nke ọma. Maka nke a, ọkaikpe ukwu na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Dennis Mmadụechesi yigharịrị ya bụ ikpe iji nye ohere ka onye ọbụla kwado nke ọma. Mana akwụkwọ akụkọ e kwekọrịtaghị n'ụbọchị e yigharịrị ya bụ ikpe. Ụfọdụ sịrị na ọ bụ ụbọchị asaa n'ime ọnwa Mee, ụfọdụ si na ọ bụ na March 12 2018. Chetanụ na Dim Odumegwu Ojukwu hapụrụ tigbuo zọgbuo sochiri ya azu maka ndọrọndọro akụnaụba nna kemgbe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52345626,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52345626,Akụkọ na m chọrọ ịba mahadum Imo Abba Kyari bụ okpotokpo asị- Hope Uzodimma,Okwu na-efegharị na gọọmenti Imo steeti chọrọ ịbagharị mahadum Imo steeti Mallam Abba Kyari University bụ okpotokpo asị.,"Onye mgbasa ozi gọvanọ Imo steeti bụ Oguwuike Nwachuku gwaara BBC nke a. Akụkọ pụtabụrụ na gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma kwuru na na ha na-akwado ịbagharị mahadum ahụ aha onye bụbụ onyeisi ọrụ Buhari nwuru n'ihi coronavirus. Akụkọ ụgha ahụ kwukwara na gọvanọ Uzodimma na ndị ọnụ na-eru n'okwu na-enwe mkparịtaụka gbasara ya bụ atụmaatụ. 'Peter Obi egoghị ụlọ ọbụla n'Enugwu' Valentine Obienyem bụ ọnụ na-ekwuru Peter Obi bụ onye bụbụ gọvanọ Anambara nakwa onye soro zọọ ọkwa dịka osote onyeisiala n'okpuru patị PDP sị na onweghi ụlọ ọbụla o goro n'Enugwu. Maazị Obienyem sị na ya hụrụ akụkọ na twitter na-ekwu na Peter Obi goro ụlọ Dọkịnta Chu Okongwu dị n'Oba Close, na GRA Enugwu. Ọ si; "" Ka m kwusie ya ike na Maazi Petetr Obi egoghi ụlọ ọbụla dị n'Enugwu maọbụ ebe ọbụla na Naịjirịa."" Ọ sị na Maazị Obi nwere ụlọ n'Onisha. ""Oge Ọkaiwu Sullivan Chime na-achị Enugwu steeti, o nyere Obi ala chara acha mana ọ gwara ya na ya achọghị ya makana ya agaghị ebinwu ebe ọzọ abụghị Anamabra ka ọ chịchara steeti ahụ afọ asatọ,"" Ọ sị na Obi sị na ọ bụ sọsọ ya bụrụ na onwere ebe ọrụ kpọgara ya bụ na ya ga-ebi n'ebe abụghị Anambara. Maazị Obienyem sị na gọvanọ Abịa na Delta nyekwara Maazi Obi ofu onyinye ahụ mana ọ jụrụ. N'onu ya, ọ sị, ""Obi na-ekwu kwamgbe na ya abụghị ogbenye. Ọ bụ onyeisi ọtụtụ ụlọ ọrụ tupu ọ bụrụ gọvanọ. ""Ọzọkwa bụ na nna ya bụ ọgalanya ama ama n'Ọnisha ma bụrụkwa onye nwe UlO ahịa akpọrọ ""Ideal Supermarket"" bu nke kachasị tupu alụọ agha n'Ọnisha ahụ kwa. ""Ụmụnne ya jikwa ihe."" Ọ sị na ihe Maazị Obi na-arụ ugbua bụ ịga ụlọ akwụkwọ na-enyere ha aka nke bụkwa ihe na-enye ya ọṅụ dịka ihe ọ chọrọ bị inyeghachi ọha. ""Maazị Obi nwere ego ọ ga-eji zuo ụlọ ebe ọbụla ọ chọrọ mana ọbụghi ihe di ya n'obi ugbua,"" Maazi Obienyem si. Peter Obi na-ewu na Twitter Naịjirịa kemgbe ụtụtụ ụbọchị 20 nke ọnwa Epreelụ 2020 dịka ndị mmadụ na-ede ""hashtag"" SaintPeterObi asi na o goro mbada ụlo n'Enugwu. Egbuola nwoke gbagburu mmadụ 16 na Kanada ụgbọala gbara ọkụ oge a na0achụ nwoke a. Ndị uweojii ekwuola na otu nwoke aha ya bụ Gabriel Worthman gbara afo iri ise na otu ji egbe gbagbuo mmadu iri na isii nke gụnyere otu onye uweojii n'obodo Nova scotia nke dị na mba kanada n'ụbọchị satụde alaala mụọ dịka ndị uweojii na achọ ijide ya. Otu onyeisi ndị uweojii bụ Chris Leather gwara ndị ntaakụkọ na ha chọtara nwoke a n'ụbọchi sunde n'ebe gwongworo ya a nọ. Leather kwuru na ha amatabeghị ebum n'ụche nwoke a ma kọwaa na Worthman yi ụfọdụ uwe ndi uweojii ma nyara kwa ugbọala nke dka nke ndị ụweojii nke mere ka ijide ya sie ike. Ọ kọwara na mkpamkpa bụ nkata agbara nke ọma ebe nwoke a ji ụgbọala ndị uwe ojii na uwe ha were gbuo ọchụ a. Leather kwukwara na ha gwara ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ ma meche ụzọ ha mgbe ha na-achọ Worthman. Onyeisi otu ndị uweojii bụ Brian Suave kwuputara obi iri-uju ha ọkachasị onyeuweojii bụ Constble Heidi Stevenson onye nwụrụ n'aka nwoke a ma too ndị uweojii niile tinyere aka n'ijide nwoke a ọkachasị ndị merụrụ ahụ. Onye ọchịchị obodo Nova Scotia kwuru na obodo a ahutubeghị ụdịrị mkpamkpa mbụ ma sị "" amaghị m na ọ bụ ụdịrị akụko a ka m ga-eji teta ụra n'ụbọchi taa, na otu onye omekome na-agba egbe aghara aghara"". N'otu aka ahụ ka onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau kwuru na akara twitter ya "" Obi anyị nọnyere ndi niile mkpamkpa a metụtara, anyị so unu eri uju""." media-48118708,https://www.bbc.com/igbo/media-48118708,Workers day: Ihe ikwesiri ịma maka ụbọchị ncheta ndị ọrụ,Ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ dum ka ndị ụwa wepụtara maka ịcheta mbọ ndị ọrụ Bekee na-agba n'ụwa gba gburugburu.,"Ka ncheta ụbọchị ndị ọrụ sị akpọtụ n'Enugwu Ihe ndị bụ ihe ịkwesiri ịma maka ụbọchị a pụrụiche bụ ụbọchị ezumike ndị ọrụ na Naịjirịa nakwa mbaụwa niile. Na Naịjirịa Naịjirịa malitere ịnye ezumike maka ụbọchị ncheta ndị ọrụ n'afọ 1981 mgbe Shehu Shagari na-achị. Ọ mere nke a maka ịkwado mbọ ndị ọrụ Bekee gbara nakwa nke ha ga-agba n'ọdịnihu na nkwado gọọmentị etiti nakwa nke steeti. kemgbe ahụ, ndị ọrụ na steeti niile dị na Naịjrịa na-enwe ezumike n'ụbọchị dị otu a. Ha na-agakwa akwụ n'ahịrị n'ọgbọ egwuregwu nọ n'isi obodo dị iche iche bụ ebe onyeisiala maọbụ gọvanọ steeti ga-ekwu okwu dịmkpa metụtara ndị ọrụ. Na Mbaụwa Ụbọchị ncheta ndị ọrụ malitere na Chikago mba Amerịka n'afọ 1886 bụ ebe ndị ọrụ nọ gbaa abụbụọrụ maka mmegbụ, ogologo awa ha na-arụ ọrụ nakwa obere ego a na-akwụ ha. Akụkọ kwuru na mmadụ asatọ nwụrụ na ngagharịiwe ha mere bụ nke butere abụbụọrụ nke mere ha ji siwe ọnwụ itinye naanị awa asatọ n'ọrụ kwa ụbọchị. Workers Day n'Abia N'oge mbụ, ha na-arụ ọrụ awa iri na ise, mana ka ha gbachara abụbụọrụ a ha malitere itinye naanị awa asatọ n'ọrụ. Ọ bụghị mbaụwa niile na-enwe ezumike n'ụbọchị dị etu a. Ebe ụfọdụ obodo na-akpọ ya ""Labour Day"", ndị ọzọ na-akpọ ụbọchị taa ""Workers Day"". Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47575708,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47575708,2019 elections: Obi adịghị ọtụtụ ndị Igbo mma ka ntụlịaka si gaa,Akụkọ dị mkpa: Goddy Uwazuruike amaala ọ kwa ajọ ihe na Naịjirịa,"Goddy Uwazuruike aka chiburu Akaikenga Onye bụbu onye ndụ Akaikenga bụ Goddy Uwazuruike arịọla ndị Igbo ka ha mụrụ anya ka azụ n'ọchịchị nke abụọ Onyeisiala Muhammadu Buhari. Uwazuruike kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịtaụka bụ ebe ọkwenyere na obi adịghị ọtụtụ ndị Igbo mma maka mpụtara ntụlịaka 2019. PDP nabatara ihe Inec nyochapụtara na Rivers steeti Otu PDP anabatala mkpebi INEC gbasara mpụtara ntuliaka nke gọvanọ na nke ndị omeiwu bụ nke emere na Rivers steeti. Otu ahụ Inec hibere maka isimi n'ala ịmata nke bụ eziokwu na ntụlịaka ahụ kwuru na ha ji ihe agụtara na ntụlịaka nke ndị gọvanọ nakwa nke ndị omeiwu si na ọkpụrụ ọchịchị iri na asaa (17) nke steeti ahụ. Ndị otu egwe egwe Yellow Vest na France N'ofesi, ndị otu ekwe ekwe eji uwe odo odo mara na France esiele ọnwụ ịme ngagharị iwe agbanyeghị na onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron ekwuola na ya agaghịzị ebuli ọnụ mmanụ ụgbọala bụ nke ha jiri malite ya bụ ngagharị iwe kemgbe afọ gara aga. Mmadụ isii nakwa ndị uweojii dị iri na asaa (17) meruru ahụ na nke ikpeazụ a ha mere. SC Sfaxien 1 - 0 Rangers Rangers International FC Enugu N'egwuruegwu, ndị otu egwu bọọlụ C S Sfaxien nke Tunisia ejirila otu ọkpụ chụla Enugu Rangers na otu B nke Confederation Cup agbara taa n'Enugu. Gee Nkeji Igbo ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Buhari katọrọ igbu mmadụ na Kaduna Onyeisiala Muhammadu Buahri akatọọla ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara Kaduna steeti ebe o kwuru sị na ụdịrị ọgụ na mgba a anaghị enwe onye mmeri maọbụ onye e meriri. Buhari kwuru na ọ na-arụ ya afọ na onweghịzị ihe ọ dị ndị mmadụ ka ikwafu ọbara aghara aghara. Lee ihe o kwuru na Facebook: Okwu ya na-abịa ka a wakporo ma gbuo ihe karịrị mmadụ iri na steeti ahụ ụnyaahụ. Ọṅụ ndị Imo o si ebee? Onyeisi odeakwụkwọ nke Adams Oshiomhole bụ Simon Ebegbulem, ekwuola na ọṅụ ndị mmadụ na-enwe n'Imo steeti ka e mechara ntuliaka ọkwa gọvanọ abụghị maka mmeri Emeka Ihedioha. Ebegbulam kwuru na obi ụtọ ndị mmadụ bụ makana Gọvanọ Rochas Okorocha na-apụ n'oche ọchịchị ahụ n'ọnwa Mee, 2019. N'ofesi, Ndị uweojii mba New Zealand ekwuola na enweghi onye nyerela Brenton Tarrant aka ịkpa arụ n'ụlọụka alakụba abụọ dị n'obodo Christchurch ebe ahụ. Tarrant bụ onye a na-enyo maka igbagbu mmadụ iri ise ma merụọ mmadụ iri ise ọzọ ahụ na mwakpo mba ahụ na-ekwu bụ nke kaschasị ọjọọ merela na mba ha. N'egwuregwu, Ndị Manchester United ka onye ọbụla kpụ n'ọnụ maka etu ndị Wolverhampton si were goolu abụọ a satara otu gwọọ ha ara ma chụpụ ha n'asọmpi Iko FA. Gụọ maka ihe mgbu ha n'uju ebe a: Wolves agwọọla Man Utd ara Ebe ogbo ha bụ Manchester City lara na nta ka ha si na goolu abụọ Swansea jibu na-emeri ha, sachaa ya ma tụkwasị ya otu iji lafere ma banye agba nke ngwụcha-ikpeazụ. Gụọ maka etu chi Man City si zọọ ha ebe a: Man City egwukpọọla Swansea anya Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka" afirika-55252934,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55252934,Etu Mbaka na ndị na-eso ya siri wakpoo ndị ntaakụkọ BBC n'Enugwu,Ọnụ na-ekwuru Adoration Ministry n'Enugwu bụ Maximus Ugwuoke agọọla na awakpoghi ndị ntaakụkọ BBC n'ogige ụbọchị Wenezde.,"N'ime akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka, Ugwuoke dere na akụkọ mwakpo ahụ bụ ""nkata a kpara iji metụọ aha Fada Ejike Mbaka"". Ọ sịkwa na obi ọma Mbaka agaghị ekwe ka ọ sị ka awakpo ndị ntaakụkọ BBC maọbụ onye ọbụla. Cheta na ụkọchụkwụ ụka Katọlik n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka na ndị ọrụ ya kụrụ ndị ntaakụkọ BBC Igbo mmadụ abụọ nakwa ọkwọụgbọala ha ihe tinka kụrụ pan ma nara ha ekwentị ha na ngwaọrụ ntaakụkọ ha n'ogige Adoroation Mbaka n'Enugwu. Obianinwa, Agbanelo na ụkọchukwu du ha bụ Rev Fr Cajetan Obiekezie gara n'ogige 'Adoration Ministry Enugwu' ịgba Mbaka ajụjụọnụ oge a wakporo ha. Ndị ọzọ so gaa njem a bụ Ndubuisi Nwafor, bu ọkwọụgbọala nakwa onye enyemaka Fada Obiekezie bụ Solomon Orakam. Ọ bụ n'Elekere iri nke ụtụtụ ka ndị ruru ụlọ ụka Mbaka. Dịka Obianinwa bụ onye ntaakụkọ anyị duru ndị ọzọ gaa ya bụ ije si kọwaa, nke a mere dịka ha chere Mbaka ihe ruru awa atọ. Ọ bụ n'Elekere ise nke ehihe ka ha niile si ụlọụka ahụ gawa be Mbaka ịgba ya ajụjụ ọnụ a. 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ' Obianinwa sịrị: ""Anyị bịara ịgba Fada Mbaka ajụjụ ọnụ n'Adọration (oge ekpere na-aga), mana ọ gwara anyị ka anyị gaa n'ụlọ ya nke dịkwa n'ogige ahụ chere ya. ""Anyị chere ọtụtụ awa tupu ya abịakwụte anyị, ma gbanwe, bido na-egosi iwe, sị na anyị dere akụkọ ọjọọ banyere ya."" ""Fada Mbaka nyere ndị okorobịa ya iwu ka ha nara anyị igwe e ji ese onyonyo na ekwenti anyị ma tie anyị ihe."" Obianinwa siri na ndị a Mbaka kpọtara yiri ha egwu ma sị na ha ga-egbu ha maka ide akụkọ megidere Mbaka. Onye ntaakụkọ BBC sị na oge ndị a na-aba mba, Mbaka na Obiekezie si n'ime ụlọ ebe ha nọ pụta were tụwa ya aka n'ihu na-akpọ ya ""satanic"". Ọ sị: ""Ọ bụ mba Mbaka na-aba mere ka ndị okorobịa malite bawa oke mba ma majawa ha. Ihe Fada Obiekezie kwuru maka Mbaka ""Ha sepuru ""wig"" m kpu n'isi ma tọdo Agbanelo n'olu. Fada Obiekezie bịara isi ka ha kwụsị mana ha wakporo ya ma nara ya ekwenti ya."" Obianinwa sị na ọ bụ oge ya malitere iti mkpu na ""ụwa ga-anụ na ọ bn̄ụ na be Mbaka ka egburu ndị ntaakụkọ BBC"" ka mwakpo a kwụsịrị. Obianinwa sị: "" Ọ bụ ugbua ka Mbaka sị ka anyị pụọ tupu ndị otu ya egbuo anyị. Ọ gwara ha nye anyị ngwa ọrụ anyị. Ha chụpụrụ anyị n'ebe ahụ. Ndị otu ya so anyị n'azụ ruo oge anyị hapụrụ Enugu ịchọ ọgwụgwọ na enyemaka ndị uweojii."" Ha mechara nyeghachi ha igwe onyonyo ahụ na ekwentị ma dupụ ha n'ogige ha dị n'Emene. Fr Obiekezie kwukwara otu ihe ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na ya gara gwa Fada Mbaka isi ije ndị BBC. Ọ sị na Mbaka kwere nkwa na ọ ga-aza ha ma o mecha adọration mana ọ tụgharịrị gosiwa ha iwe."" Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik Fr Obiekezie, sị na ya bụ enyi Mbaka, na BBC Igbo nweburu mkparịtaụka ebe ọ katọrọ Mbaka maka ụfọdụ okwu ndọọndọọ ọchịchị ọ na-etinye ọnụ na ya, nke o kwuru na o kwesịghị ekwesị. Father Mbaka bụ ụkọchụkwụ ụka Katọlịk a ma ama na Naijiria maka amụma ọ mara tupu Ntuliaka 2015 na Muhammadu Buhari ga-emeri aka na-chị Naijiria oge ahụ bụ Goodluck Jonathan. Maazị Ugwuoke sị na Mbaka Adoration Ministry akpọghị BBC ịbịa ịgba Mbaka ajụjụ ọnụ; mana ndị ntaakụkọ BBC sị na onye du ha gaa ebe ahụ gwara Mbaka na ha na-abịa. Akwọkwọ mgbasaozi o wepụtara sị na ndị BBC batara ka ndị amaghị ndi ha bụ ma na-esi onyonyo na nzuzo, mana ndị ntaakụkọ BBC kwụsịrị ike na ha emeghi etu a ma ncha. Akwụkwọ ahụ sịka na Fada Obiekezie bụ bụ onye ya na Adoration Ministry adịghị na mma naka mkparịtaụka ya na BBC mere. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-50856699,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50856699,Oraifite Killings: 'Ifeanyi Ejiofor ka bu onye anyi na-achọ achọ - Ndị Uweojii,Ndị uweojii Anambra steeti sị na ha enwetebeghi iwu si n'ụlọikpe sị ka a ghara inwuchi ọkaiwu Ipob bụ Ifeanyi Ejiofor.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed gwara BBC Igbo na ha amaghi ebe akụkọ na-ekwu nke a siri pụta. Oraifite Killing: 'Anya hụrụ Ifeanyi Ejiofor na ndị otu ya gwa anyị'- Uweojii Mohammed sị na ha ka na-achọ Ejiofor achọ dịka ụlọikpe si nye ha ikike ruo mgbe ụlọikpe a ga-ekwugharị. Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uwojii na ụfọdụ ndị eche na ha bụ ndị Ipob n'ụlọ Ejiofor dị n'Oraifitte, Anambra n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba. Nke a butere ọnwụ ndị uweojii abụọ, ịkpọ ụlọ Ejiofor nakwa ụgbọala ndị uweojii ọkụ. Ejiofor bokwara ndị uweojii ebubo igbu ndị nkwado ya mmadụ anọ bụ nke ndị uweojii gọnarịrị. Ụlọ ọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters dere na ụlọikpe sị ka a ghara inwuchi Maazị Ejiofor. Mbọ BBC Igbo gbara inwete Ejiofor amitaghi mkpụrụ maka ekwenti ya agaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52740065,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52740065,Igbo Landing: Etu ụmụ Igbo si gosi 'ofu obi' n'ihu mkpagbu n'oge gboo,"Agha Biafra bụ otu oge were anya Igbo gosiri na ha nwere 'ofu obi', mana ị ma na nke a hụ abụghị mbụ ha?","Ndị e resịrị ndị ọcha n'ohu oge gboo Ha egosibuola ụkpụrụ a 'Igbo Landing' oge gboo. Oge elu bụ ala ọsa, oge ezi si n'ukwu ụkwa gaa, ndị Igbo na-erefu onye isi ike, onye dara iwu obodo, maọbụ onye gbara arụ. Ụfọdụ ndị mmadụ bidoro rewe ndị ji ha ụgwọ, ndị merụrụ ala na ndị ha jidere ma obodo na obodo lụọ agha. Ndị meriri ha kpụrụ ndị ha meriri refuo ha na-eresị ndị ahịa isi oji ibe ha. Mana ka chi na-efo, bido na ""15th Century"" rue ""19th Century"", mgbe ndị ọcha batara ala isiojii, ụfọdụ malitere iresi ha ndị ha gbara n'ohu nke a ma dịka, ""transatlantic slave trade"" na Bekee. Mgbere mmadụ were ghọọ ahịa ntụ nke na ụfọdụ na-atọrọ mmadụ ibe rewaa ha anya. N'afọ 1803, n'ụzọ dị ịrịba ama, ụmụ Igbo ruru narị atọ(ụfọdụ akụkọ sị na ha dị iri asaa na ise) e resiri ndị ọcha nọrọ n'ebe a kpọrọ Dunbar Creek dị na St Island na Georgia dị na mba Amerịka nupụ isi jụ ịbụ ohu kama hara mmiri iri ha.' Slave Trade: Ihe ọkpụ fọrọ maka ịgba ohu n'ala Igbo Ọtụtụ ndị mmadụ n'ala Bekee na-ahụta nke a bụ mbụ ndị mmadụ n'egosi ekweekwe nye mmekpa ahụ n'igwe na mba Amerịka. Ọkammụta Igbo na mahadum, University of Lagọs, bụ Chigozie Nnabuife kọwara na ihe butere agwa ahụ bụ na : ""Ndị Igbo kpọrọ onwe ha kwetara na ohu abụghị nwa. Ha were ohu dịka anụmanụ nkịtị."" N'ọnụ ya ""Ya mere na a na-agọrọ ohu mụọ, e meghị otua ya gbala ga."" ""Ha nọ n'ụgbọ were Igbo kpaa nkata kpebie na ha enweghị ike fee nwoke ibe ha ohu ka anụmanụ, na ọ kara ha mma ịnwụ anwụ. Ha kpebie na ha ruo ebe ebu ha ga,ha jide onwe ha aka dakpuo mmiri."" Akụkọ 'Igbo landing' bụ abụbụ akụkọ si n'aka fere aka nke ndị isiojii Amerịka na-akọ dịka akụkọ ifo tupu edebanye ya n'akwụkwọ n'agbata 1930. Taa e nweziri emume e ji echeta ụbọchị ahụ, dịka akụkọ kwuru na mmụọ ndị ahụ ka na-akpagharị ebe ahụ rue taa. Ka ọ dị ugbua a na-agụ ihe gbasara 'Igbo Landing n'ụlọakwụkwọ ụfọdụ dị na Georgia. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44359285,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44359285,Akụkọ kachasị n'abalị a: Mmadụ 25 anwụọla site na volukeno na Guatemala,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n' abalị a :,"Abụbọ ọrụ n'ụlọọrụ mịnịsịtrị sayensi na nka na ụzụ Some NLC members marched in Abuja in support of the strike Ndị ọrụ nọ na mịnịsịtrị sayensị na nka na ụzụ na ndị nkuzi na-arụ n'ụlọakwụkwọ na-eme nyocha awụsala ngwọ ọrụ ha n'abụbọ ọrụ. Ha kwụsịrị ọrụ na mịnịstrị ahụ na-ekwu ka e wepụ ode akwụkwọ ụlọakwụkwọ ndị ahụ bụ Shamaki. Naịjirịa Ego ụtụ ibubata mmanya ọkụ na anwụrụ etinyekwuola Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse anwụrụ na Naịjirịa Ndị niile na-ebubata mmanya ọkụ na anwụrụ bido taa ga-amalite ịkwụ ụgwọ ụtụ e ji ebubata ngwọahịa nye gọọmenti etiti. Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ. Akụkọ mba ofesi Ọgbatauhie dakwasịrị mba Guatemala Fuego volcano has been spewing ash and smoke Ajọ ihe mberede volukeno mere na Guatemala taa egbuola mmadị iri abụọ na ise. Volukeno ahụ mere taa kachasị njọ na nke merela ebe ahụ kamgbe afọ otu narị. N'egwuregwu, E zuru Kanu Nwankwo ohi na Rọshịa taa ruru puku dọla iri na otu. Serena Williams esepụla aka n'asọmpi French Open tupu ọ ga-ezute Maria Sharapova Ndị mmadụ mmadụ na-ajụ ka ọ bụ ụjọ mere Serena jiri sepụ aka mana akụkọ kwuru na Serena nwere mmerụ ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Di na nwunye mụrụ ejima atọ" afirika-44085414,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44085414,Agbaala ụlọọrụ APC dị n'Imo ọkụ,Ụmụ agboro a na amaghị aha gbara ụlọọrụ APC dị n'imo steeti ọkụ.,"Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga Onweghị ndị mmenyụ ọkụ bịara mmenyụọ ọkụ a. Ọkụ a gbaranụ mebiri ọtụtụ ihe dịka ngwaọrụ nakwa akwụkwọ dimkpa nke bekee kpọrọ 'document'. Onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ APC n'Imo steeti bụ Hilary Eke, kwuru na mkpamkpa a bụ akaọrụ ndị omekome chọrọ imebi ọgbako nke okpuru ọchịchị kwesịrị ime taa. Eke ṅụrụ iyi sị na a ga-emerịrị ya bụ ọgbakọ nke okpuru ọchịchị makana nke e mere n'izuụka gara nkeọma. Ọ rịọrọ ndị na-emerighị na nke gara aga ka ha kwe ka udo chịa. N'ọnụ ya, ""ọgbakọ agaghị eme n'ụlọọrụ APC mana ọ ga-eme n'okpuru ọchị ruru 27 n'ọnụ ọgụgụ."" ""Ọrụ m bụ ikpesara ndị uweojii ka ha nyochaa ma chọpụta ndị kpara mkpamkpa a."" Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-50103753,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50103753,Manchester United vs Liverpool: Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ,"Liverpool tiwara ndị ji ha hibe isi maka imeri Manchester United obi taa, ka ha gazịrị bụrụ ndị na-asa goolu.","Ọtụtụ ndị gụnyere ma ndị na-akwado Man Utd, chere na ha ga-eji goolu gbajuo ndị Man Utd afọ maka etu ahụ si ama ha ririri na bọọlụ kemgbe izu ole na ole gara aga. Mana ha bịara ""teta n'ụra"" n'azụ ụlọ ha na Old Trafford, wee sị ndị Liverpool ""ọ bụghị taa!"" ka egwuregwu mechara bie n'otu goolu otu goolu. Adam Lallana nke Liverpool ji ibu kara aka gbakaa neetị David De Gea na nkeji 85 na-erughi nkeji ise e webatara ya na bọọlụ, iji sata otu goolu Man Utd nyere ha n'ọkara nke mbụ. Lallana batara n'ọkara nke abụọ gbaa aka ahịa na-emeghị eme Marcus Rashford bu ụzọ bie Alisson ""stamp"" ka ọ gbakara neetị ya na nkeji 36 e ji bido bọọlụ. Maka etu goolu a si gaa, e mechara were ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) ji nyochaa ya, iji mara ma ọ dabara. Ka ọ dị ugbua, Man Utd esila n'ogogo 14 rigoro nke 13 na tebulu, ebe Liverpool ka nọkwa bụrụ ndị a na-emeribeghi kemgbe Premier League nke afọ a bidoro. Ihe ndị mmadụ na-ekwu: @Kheeng_jay na-ama ndị Man Utd njakịrị sị na ha si ebe ha zoro maka ụjọ mmeri na-arịpụta. @UgwunnaEjikem sị na ọ dị ka ike adịghị ndị Liverpool ịzọ ọkwa mbụ na Premier League nke afọ a, maka etu ha si atufu pọịntị. @ivanmerlo21 tinyere ihe na-egosi etu obi si dị ndị Man Utd pọlịna pọlịna oge Rashford nyere goolu ya. @AJno9 kwuru na ọ bụ ogbuopi ka e kwesịrị inye ""ọkacha gbaa n'egwuregwu a"". Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-43287449,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43287449,Kenneth Okonkwo: Enugwu steeti nọ n'agbụ ugbua,"Onye na-eme ihe nkiri bụ Kenneth Okonkwo nke e ji ""Andy Okeke"" mara ekpebiela na ya ga-azọ ọchịchị ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019.","Kenneth Okonkwo na-azọ gọvanọ Enugwu n'okpuru pati APC Kenneth bụ onye Nsukka dị n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụ mmasị ya ime ka Enugwu steeti ga n'iru dịka ọrụ nkiri ha bidoro na Naịjirịa si gaa n'iru. Kenneth so na ndị mere ka ọrụ nkiri Naịjirịa bụrụ ihe na-ewuewu na mba ụwa dịka o sonyere na ihe nkiri e mere n'asụsụ Igbo a kpọrọ, ""Living in Bondage"". Kenneth Okonkwo kọwara BBC Igbo na ihe nkiri ọ na-eme bidoro ka ihe egwuregwu na ihe iji nwe aṅụrị na abụghị akaọrụ mana ọ gara nke ọma bụrụ ihe mepụtara ihu Naịjirịa. O kwuru na dịka ya siri ga n'ihu n'ọrụ nkiri ka ya siri chọọ ime ka Enugwu steeti gaa n'ihu. Kenneth katọrọ ọchịchị Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi bụ aka na-achị Enugwu steeti kwuo na ndị Nsukka anaghị enwe aṅụrị n'ọchịchị ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na nanị afọ anọ ka ya chọrọ ịchị. Kenneth na-azọ ọchịchị na pati APC Ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị APC. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe ndị ị na-amaghị maka Kenneth Okonkwo 1. Ọ bụ onye Nsukka dị n'Enugwu steeti. 2. O mere agwa Andy Okeke n'ihe nkiri a na-akpọ ""Living in Bondage"" nke e mepụtara n'afọ 1992. 3. Ọ bụ onye ọkaiwu, ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum UNN nakwa UNILAG. 4. Ọ lụrụ nwa ụkọchukwu ya n'afọ 2000 mana ha gbara onwe ha alụkwaghị m n'afọ 2002. 5. Ọ mụrụ ọkpara ya n'afọ 2016 ka ọ gasịrị afọ itoolu ọ lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Ifeoma Okonkwo. Kenneth esonyela ndị na-eme onyonyo bara ndọrọndọrọ ọchịchị Kenneth nwere nkwado aka chịburu Enugwu bụ Sullivan Chime Ndị na-eme ihe nkiri na Nollywood dịka Desmond Elliot, Kate Henshaw na ọtụtụ ndị ọzọ esirila na ihu TV banye ọrụ gọọmenti na steeti ha dị icheiche. Kenneth Okonkwo gwara BBC Igbo na ya nwere ntụkwasị obi na ndị Enugwu ga-akwado ya dịka aka chịburu Enugwu Sullivan Chime kwadoro ya. N'aka nke ọzọ, onyeisi pati APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na Kenneth pụrụ imeri ntuliaka n'afọ 2019. Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nọ pati PDP dịka ọchịchị ya ugbua bụ nke mbụ." afirika-48947538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48947538,Nigeria Poverty Index: Ị dara ogbenye?,Akwụkwọ mpụtara ọhụrụ nke otu enyemaka bụ Oxfam wepụtara na-ekwu na pasentị 69 na mmadụ niile nọ na Naịjirịa dara ogbenye.,"Ọtụtụ mmadụ na arụ ọrụ aka, mọ na azụ ahia Mgbakọ ya gosiri na ọ bụ mmadụ nde 138 n'ime ihe karịrị nde 200 bụ ihe dara ogbenye na Naịjirịa. Constant Tchona bụ onyeisi Oxfam na Naịjirịa kwukwara na Naịjirịa nọ n'ọkwa 125 n'ime mba 145 n'enweghi nhata nha. O kwuru na gọọmentị etiti anaghị enyere ọnọdụ a aka site n'etinyeghi ego n'ihe gbasara ahụike, agụmakwụkwọ, mmiri ziri ezi nakwa ọnọdụ ụmụnwaanyị. Etu ịga esi maraonye gbara ogbenye? Tomato na-adị arị elu n'oge udu mmiri. Ụlọakụ Mbaụwa niile bụ World Bank manyere atụmatụ iji chọpụta ndị dara ogbenye na mba ọbụla n'afọ 1993. Ya bụ na ọbụrụ na ịnaghị erite otu dọlla pụtara narị naira atọ na ọma kwa ụbọchị, ọ pụtara na ịdara ogbenye. Mana ugbua, a na-elegara ihe ndị ọzọ anya ịji chọpụta ọnọdụ ogbenye dịka: Ihe ndị ọzọ mpụtara ahụ kwuru O nwere ụfọdụ ihe ndị ọzọ si na ya bụ akwụkwọ mpụtara pụta gụnyere: Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme? Ọtụtụ mmadụ na-arụ ọrụ aka maọbụ na-ere ahịa iji jide obi aka Gọọmentị Naịjirịa malitere ụfọdụ atụmatụ iji hụ na achụpụrụ ụbịam kpam kpam na Naịjirịa. Ha gụnyere YouWin bụ nke bidoro n'afọ 2012 bụ nke na-enye ndị ntorobia chọrọ ịbido ahịa ego mbite. Trader-Moni bụ atụmatụ ọzọ yiri ya na-enye ndị na-azụ ahịa ego mbite iji kwalite ahịa ha. Ọzọ bụ N-Power bụ atụmatụ na-akwụ ndị enweghi ọrụ ụgwọ na-akuzikwara ha ihe tupu ha enweta ọrụ. Mana ihe ndị a amịtabeghị mkpụrụ dịka ngụkọ ụbịam na-egosi na Naịjirịa ka na-abanye ụbịam n'ike n'ike. Child bride: Ụbịam so ebute nsogbu iluchu di Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-43152840,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43152840,Mwakpo Yobe: 'Anyị amaghị ebe ụmụ anyị nọ',"Mmadụ ise n'ime ha tụbọrọ ozigbọ ha nụrụ n'ọnụ Gọvanọ steeti ahụ bụ Ibrahim Gaidam na ụmụ ha na-efu efu na amaghị ebe ha nọ, ebe ụfọdụ gosiri iwe ha.","Ihe ruru ụmụakwụkwọ GGSTC iri itoolu bụ ndị a na-achọ achọ kemgbe ụbọchị iri na itoolu ọnwa Febrụwarị mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram wakporo ha Ụfọdụ ndị nne na nna nọ ebe ihe a mere gwara BBC na ha hụrụ ka a na-atụ Gọvanọ Gaidam na ndị so ya okwute ka ha bịachara ịhụ ezinaụlọ ndị ọdachi a metụtara. Malami Jumai Abubakar nke ụmụ ya atọ na-agụ na Government Girls Science Technical College (GGSTC), Dapchi, dị na Yobe Steeti tụrụ arịrị na ya ahụbeghi ụmụ ya abụọ kamgbe ụbọchị Monde 19 ọnwa Febụrụwarị oge ndị a e chere na ha bụ ndị Boko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ahụ. ""Mụ na ụmụaka m kparịtara ụka n'ekwenti onye nkuzi ha n'ebe elekere abụọ nke ehihie. Mana ọ bụ oge e kpechara ekpere mgbede ka anyị nụrụ maka mwakpo mere n'ụlọ akwụkwọ ha. ""Anyi gara n'ụlọakwụkwọ ha ụbọchị Tuuzde, ndị gọọmenti gwara anyị na onweghị ihe mere ụmụakwụkwọ, na onweghị onye na-efu efụ, ma rue ugbua Tọzdee, ahụbeghị ụmụ m abụọ."" Kundiri Alhaji Bukar kwuru: ''Anyị na-eche ozi n'aka Gọvanọ mana mgbe ọ kpọkọbara anyị, nne na nna ụmụakwụkwọ na-efu efụ, ọ gwara anyị ihe mere ka obi dị anyị njọ karịa ka ọ dị mgbe anyị nwetara ozi banyere mwakpo ahụ. Ogwara anyị na ezigara ndị agha mana onye isi ha gwara ya na ha ahụghị ụmuaka ụmụnwaanyị ahụ n'aka ndị Boko Haram. O kwuru na onweghi onye o doro anya na ọ bụ Boko Haram tọrọ ha. ""Mana anyị kwenyere na ọ bụ Boko Haram. N'aha Chineke, ọ bụ Boko Haram kpụrụ ha. Ihe Govanọ kwuru wutere anyị. Mmadụ ise tụbọrọ mgbe ha nụrụ ihe gọvanọ kwuru, e buru ha gawa ụlọọgwụ. Anyị bụ ndị obioma. Gịnị mere ha ji eme anyị etu a? Ha gwa anyị ezị okwu ihe mere ụmụanyị."" Onye ọzọ achọghị ka a kpọ aha ya kwuru: ""N'abalị ụnyaahụ, ozi anyị nwetara bụ na azọpụtala ụmụaka ụmụnwaanyị. Obi anyi rituru, anyi na-ekele ndị ọchị agha maka na gbalịrị. Anyị chere na ha ga akpọnye anyị ụmụ anyị taa. Mana Govanọ gara n'ụlọ onyeisi obodo ebe ndị nne na nna ndị ụmụaka ha na-efu efu gbakọrọ. Ihe gọvanọ kwuru bụ ka anyị nwe ndidi ma dere juu, na o webeghị anya ebe ụmụ anyị nọ. Okwu ahụ were ndị mmadụ iwe. Ọtụtụ bere akwa, ụfọdụ tụbọrọ, ebe ụfọdụ tụrụ ụgbọala gọvanọ na ndị so ya okwute. Ihe dịka ụgbọala iri na ise bụ ihe e mebiri."" Cheta na n'abalị ụnyaahụ, ọnụ na-ekwuchitere Yobe steeti bụ Abdullahi Bego kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara na ndị agha Naijiria azọpụtala ụmụakwụkwọ n'aka ndị oyiegwu tọrọ ha ma o kwughị ọnụọgụgụ ha." afirika-52302289,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52302289,Coronavirus symptoms: Kedụ njirimara ya m ga na-ahụ kpoku NCDC?,"Coronavirus na agbasa n'ike na ebube ebe o dulagoro mmadụ 128,886 mụọ ma jidekwa ihe karịrị nde mmadụ abụọ n'ụwa.","Eserese nje coronavirus Kedụ njirimara coronavirus? Covid-19 na-ejide n'ume maọbụ ngụgụ. Ọ na-egosipụta site na ahụọkụ nakwa n'ise ụkwara esepuaka. Ụkwara ntịrịrị anaghị akwapụta ihe ọbụla dịka imi. Ọ na-akpọ nkụ, dịka ụlọọrụ British National Health Services dere. Ụkwara esepụaka bụ mmadụ ịkwa ụkwara mgbe niile karịa otu awa, ụdị ihe ahụ mee mmadu ụgbọrọ atọ n'otu ụbọchị. Ụkwara a were ike ikanjọ karịa otu o si emebu onye ahụ. Nke a nwere ike ibute ume ibi mmadu, mee ọ di onye ahu ka eji udọ kechie obi ya nke ga-ebutere ya obi mgbu. Onye ahụ nwere ike ị nwe ahụọkụ maọbụru na ahụ ya na-ekpo ọkụ karịa 37.8C. Nke a nwere ike ịme ka ahụ kpowe ọkụ maọbụ oyi mawa onye ahụ maọbụkwa oyiọmụma. Ụfọdụ ndị ya bụ ihe mere sị na ọ na-ebutekwa akpịrị ịkpọnkụ, isi ọwụwa maọbu afọ ọsịsa. Were ncha na-akwọ aka gị oge niile Mgbe ụfọdụ onye ahu agaghịzị anụ isi maọbụ nụ ụtọ nrị. Njirimara ndị a nwere ike ịgosipụtawa n'abalị ise mana ọ bụ akarịa na ndị ụfọdụ. World Health Organisation (WHO) sị na o nwere ike izo abali iri na anọ (14) n'ahụ mmadụ tupu ọ pụta ihe. Mmadụ ole ka ọ naghị egosipụta n'ahụ ha? Nchọpụta ndị British Medical Journal gosiri na Covid-19 anaghị egosipụta na ahụ mmadu ruru pasent iri asaa na asatọ (78%) maọbụ ọnọdụ nke Bekee kpọrọ asymptomatic. Nchọpụta a kwenyere na ihe ahụrụ na Ịtali bụ ebe ọrịa nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ bụ nke gosiri na mmadụ dị na agbata pasenti iri ise rụọ iri asaa na ise (50% - 75%) egosidghị njirimara ya bụ ọrịa ma ọli dika ya bụ ọrịa di ire n'ahụ ha ma sikwa n'ahụ ndị ahụ banye n'ahụ ndị ọzọ. Nchọpụta ọzọ emekwara na Iceland gosikwara na ihe dịka mmadụ iri ise (50%) bụ ndị bu ya bụ ọrịa enweghị njirimara ya. Agbanyeghị, nchọpụta WHO mere ndị ọrịa a dị mmadụ 56,000 gosikwara: Mmadụ ruru pasenti iri asatọ (80%) ji ntakịrị isi ọwụwa, oyi na ụmeọkụ (pneumonia).egosi ya. Pasenti iri na anọ (14%) ndị ọzọ na-enwe ezigbo nsogbu njirimara dịka ume ibi onye ahụ maọbụ ekudaghị ume nke ọma. Pasenti isii ndị ọzọ bụ ndị ume ha dagoro mba maọbụ ime ahụ ha juziri ịrụ ọrụ, bụ nke na-ebute ọnwụ. Ka ọrịa nje coronavirus si ebido Gịnị ka m ga-eme ma m nwee njirimara ọrịa a? Ọtụtụ ndi nje a bara ahụ na-agbake ngwangwa ma ha zuo ike maọbu ṅụọ ọgwụ dịka paracetamol maọbụ nke Bekee kpọkwara acetaminophen. Ọbụrụ na ị nwewe ahụọkụ, ụkwara maọbu umeọkụ were ọsọ were ije kpọwa ndị ọkachamara, maka ọnwekwara ike ọ bụru ọrịa umeọkụ maọbụ ọrịa ọkpọnkụ ndị ọzọ bụ ihe ahụ. WHO sị gị kpọtụru ndị ọrụahụike ka ha gwa gị ebe ị ga-aga maka na enwere ike ohere agaghị adị ebe nke ị chọro i ga maka ihe na-ada ebe niile ugbua. Kedụ mgbe kwesiri ị ga ulọọgwụ a? Ihe kacha mkpa n'ime ihe ịkwesiri iji ga ụlọọgwụ bụ maka ume obibi. Ndị Dọkịnta ga-enyocha gị ngụgụ gị mara ka o si didebe njọ. Ọ bụrụ na ọ dị ezigbo njọ mara na enwere ike i sị onye ahụ bịa nagalaba gbatagbata Bekee kpọrọ intesive care unit (ICU) bụ ebe a na-elekọta ndị o ji na njọ. Ekwesiri itinye onye Coronavirus ji ikuku (Oxygen) nke gụnyere akwa mkpuchi imi maọbụ tubu ọ ga-eji na-ekute ume site n'imi. Maọbụ o sie ike, enwere ike iji ngwaọrụ akpọrọ 'Ventilato'r mee ka ikuku sị na ọnụ ma n'imi na-aba onye ahụ ngụgụ. Mgbe ụfọdụ, agbawa onye ahụ onu si ebe ahụ nyewa ya ikuku. Kedụ ndị ọrịa a na-akanjọ n'ahụ? Ndị nka, ndị nweburu ọrịa ""asmtha"", ọrịa suga na ọrịa obi ka ọrịa nwere ike ịka njo n'ahụ. Achọpụtakwara na ya bụ ọrịa na-aka egbu ụmụnwoke karịa ụmụ nwaanyị. Ọ bụrụ na ya bụ ọrịa ejisighị onye ahụ ike, ọ nwere ike ịgbake n'abalị ole maọbụ ole. Mana ọ bụrụ na o ruru nke onye ahụ ịga ICU, onwekwara ike irucha otu ọnwa tupu ọ nwete onwe ya. Etu ndị ọrụ ahụike nwerike ike onwe ha nkwucha ma ha na-elekọta ndị nwere coronavirus Kedụ ka ọrịa si didebe njọ? Nchọpụta edere na akwụkwọ ndị The Lancet Infectious Diseases na akọwa na naanị mmadụ pasenti 0.66 bụ ndị ọrịa a ji, ka onwere ike igbu. Nke a erughị ka ndị ọrịa 'flu' na-egbu bụ ndị dị pasenti 0.1%. Ihe nwere ike ikponye aja na garị ọnụọgụ a bụ na ọbụghị mmadụ niile ya bụ ọrịa metutere ka agụchara. Etu i nwereike iji gbochie coronavirus Kedụ ka m ga-esi chekwa onwe m? Ụzọ ka mma bụ iji mmiri na-agba agba na ncha kwọsie aka gị ike mgbe niile. Kpuchie ụkwara na uzere gị Coronavirus na-agbasa site n'ọnụ mmịrị maọbụ imi onye bu ya, mgbe ọ mara uzere maọbụ kwaa ukwara. Jiri uwe gị kpuchie ụkwara gị maọbụ uzere gị Mmadụ nwere ike ikuru ya n'ume mgbe ọ nọ n'ikuku maọbu biri ya n'aka mgbe ọ nọ n'elu ihe ọbụla imeturu aka were si otu ahụ banye onye ahụ n'imi, ọnụ maọbụ n'anya. Tufuo tishu i jiri kpuchie ụkwara maọbụ uzere gị Yaa bụ, iji tishu kwanye ụkwara maọbụ maa uzere, imetu aka ịkwọghị akwọ n'ihu nakwa ịnọpu anọpụ mgbe gị na onye bụ ya nọ di mkpa karịa. Jiri ncha na mmiri kwụọzie aka gị ruo ntabianya 20 Ndị bụ nje a nwere ike ife ya mmadụ mgbe ha ka na-egosi njirimara ya ebe ụfọdu nwere ike ịmalite ifesasị ya tupu ha adaa ọria. Akwamkpuchi ihu abụghị ihe kacha mma iji gbochie ọrịa a, dịka ndị ọkachamara si ekwu. Agbanyeghị, WHO ka na-elebe anya ịmata ka ndị mmadụ aga erita uru na ya maka na ọ nwere ike ịme ka asọmmiri maọbụ imi si onye bu ya n'ọnụ maọbụ imi ghara ịtụsa n'ebe ọzọ. Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-48733302,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48733302,Air Peace: Ụgboelu ha kwụsịrị n'ime ọhịa na Port Harcourt,Ọ fọrọ obere ihe ka ọdachi dakwasị otu ụgbọelu Air Peace mgbe ọ febara Port Harcourt ụbọchị iri abụọ na abuọ nke ọnwa June.,"Onye nọ ebe ihe mere kọwara na ụgbọelu ahụ gafere okporoụzọ ebe o kwesiri ị ga ma danye n'ime ọhịa. Dịka ọ dị ugbua o nweghi onye nwụrụ ma merụọ ahụ n'ihe ahụ ebe akụkọ ka na-abịa. End of Twitter post, 1 Gọọmentị Naịjirịa na ọgbakọ mba ụwa bụ UN n'aha ịchafụ amapụtala nde dọlla iri n'ise iji wughari etu e si ahazi atịtị si na ngwa latrịk apụta Ọ bụ Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhario kwuputara nke a site n'akara Twitter ya N'akụkọ yiri ibe ya Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin emefiele ekwuola na ya bụ ụlọakụ adila njiikere inye ndị na-efe ala nna ha mbibi ego iji bido ahịa na ihe ndị ọzọ. O kwuru na atụmatụ a ga-ebelate enweghi ọrụ nke na-enye ọtụtụ ndị ntorobia nsogbu na Naịjirịa. Na mba ofesi, Ndị ọrụ nchekwa egbuola ndị omekome echere bụ ndị Al-Shabbab na mba Kenya mgbe ha na-awakpo ụlọọrụ ndị uweojii na mba ahụ. Ọ gụ a dara n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị omekome ahụ takwara isi mmadụ asatọ bụ ndị uweojii. N'egwuregwu, Dịka ọ dị ugbua, otu Jamini ejirila ọkpụ goolu atọ gbanye ndị super falcons Naịjirịa ọgbaghara n'isi na agba nke mbụ nke asọmpi ha. Nke a pụtara na agbapụla otu Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa ụmụnmwaanyị nke 2019. Gee akụkọ na nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44213490,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44213490,Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga,Ndị Katọlik na Naijiria niile mere ngagharịiwe iji gosi obi mwute ha maka oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria.,"Igwurube mmadụ pụtara na kadụna maka ngagharịiwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa N' ọnwa Epreelụ, ndị e chere na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ndị ụkọchukuw abụọ na ndị ụka Katọlik iri na asaa ndị Fulani ọchịehi gburu na Benue. Ọgbakọ ndị Bishọp gwara ndị ha na-achịkọta ka ha mee ngagharịiwe taa dịka a na-eme emume akwamozu ndị ahụ nwụrụ taa bụ Tuusde na Benue. End of Twitter post, 1 N' okwu ya oge o du ndị ụka kaolik na ngagharịiwe, Bishọp ụka Katolik na Port-Harcourt bụ Camilus Etokudoh kwuru oke mkpa ndụ mmadụ dị ma katọọ oke igbu mmadụ. O kwuru na ngariiwe ahụ abụghị maka okwu ndọọndọrọ ọchịchị. ""Ndị ọchịehi ewegharala ọtụtụ ala anyị dịka anyị gara n'ihu na edegara onyeisiala Buhari akwụkwọ maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa."" Ndị Katọlik na Kadụna bucha ozi na-ekwu ka gọọmenti kwụsị oke ogbugbu mmadụ N'Enugwu, ndị nne, nna, ụmụaka na ndị chiri echiche n'ụka pụtara n'igwe maka ngagharịiwe. Ndị e chiri echi na Katolik sonyere na ngagharịiwe e mere n'Enugwu Akụkọ ndị ga-amasi gi:" egwuregwu-47696863,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47696863,Nigeria vs Libya: Naijiria anyụnyela Libya mmamiri n'anya,Ụmụ ugo Naịjirịa ji eme ọnụ nara mba Libya ụra n'anya site n'ịsụnwe ha ọkpụ goolu anọ chara acha anasataghị otu.,Ndị egwu Naijiria gosiri ndị Libya nkarị bido na mbido rue mgbe e gbubiri bọọlụ n'asọmpị ha gbara n'amaegwuregwu 'Stephen Keshi Stadium' dị n'Asaba Delta steeti na mgbede Monde. Ndị Libya gbara Naịjirịa ọkpụ abụọ n'ụkwụ nke mbu na mba ga nke mere ya ọkpụ anọ asatara abụọ na mgbakọ Naịjirịa ji merie. Victor Osimhen mepere neetị ndị Libya na nkeji iri atọ na abụọ asọmpị a malitere. Ọ gara n'ihu inye goolu abụọ na nke atọ na nkeji iri isii na ise nakwa nkeji iri asatọ na abụọ. Nke a mere ya ọkpụ goolu atọ nwaamadị a nyere iji nye Naịjrịa mmeri. Kelechi Nwaka gbara oke shọọtụ bụ nke gara kụọ n'igwe na-eche neetị ma mụọ na nke oche goolu ndị Libya kụpụrụ. Nwafọ Naịjirịa na-agbara Sporting bụ David Okereke sụnyere goolu nke anọ na nkeji iri itoolu na atọ dịka bọọlụ chọziri ịgwụ. Mmeri a mere ụmụ Imama Amapakabo ji tozuoke n'agba nke ikpeazụ asọmpị a ga-adị n'ọnwa Nọvemba. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-45243999,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45243999,Etu ọtụtụ mmadụ jiri nwụọ na mwakpo ndị oyi egwu na Borno,Ndị na-eyi ndụ egwu wakporo otu obodo akpọrọ Mailari dị na Borno steeti nke Naịjirịa bụ ebe ha gburu ọtụtụ ndị mmadụ.,"Akụkọ kwuru na ọnụọgụgụ ndị egburu edochaghị anya dịka onye ọrụ nchekwa ọdịnala kwuru na ọ bụ mmadụ isii kama onye hụrụ ka ihe ji mee kwuru na ọ bụ mmadụ iri na itoolu. Otu onye hụrụ ka ihe ji mee bụ Abatcha Umar kwuru na ndị a wuchiri n'ụgbọala ha n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị ụka, malite gbawa egbe ma na-atụkwa ogbunigwe. O kwuru na ọ maghị ma ndị a ọ bụ ndị Boko Haram ka ọ bụ ndị akpọrọ 'Islamic State in West Africa Province' n'olu bekee. O kwuru na ọ gụtara ozu mmadụ iri naitoolu nke gụnyere nwanne ya nwoke, mana onye ọrụ ahụike kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii na atọ nwrụrụ. Umar kwuru na ndị oyi ndụ egwu a anọọla na gburugburu ebe obodo kamgbe abalị atọ tupu ha na-eme mwakpo a. Otu onye ọzọ aha bụ Aisami Grema kwuru na ndị uweojii nọ nso ebe ahụ emegharịghị ahụ n'ibuso ndị a agha. Cheta na Boko Haram malitere ibu agha na Naịjirịa kamgbe afọ 2009. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-49210093,https://www.bbc.com/igbo/media-49210093,Biafra struggle: Ndigbo kwesiri ịbụ ụzọ mezie Alaigbo tupu e kwuwa okwu nnwereonwe Biafra - Noble Igwe,BBC Igbo na Noble Igwe nwere mkparịtaụka nke isiokwu ya bụ omenala Igbo na njirimara Igbo n'ọgbakọ 'Gịnị na-afịọ'.,"Content is not available End of Facebook post, 1 O kwuru na o kwesịrị ka Ndịgbo bido idozi ala Igbo site na ịjụ ndị na-achị ha ajụjụ etu ha si achị. Ọ jụrụ sị: ""Ihe na-eme n'ala Igbo, ọ bụ onyeisiala na-eme ya?"" Noble Igwe bụ onye mmemme a ma ama rụbụrụ n'ụlọọrụ 'Virgin Nigeria' ""Ịzọ Biafra abụghị sọsọ ime ya, kedụ ihe anyị meerela n'Igbo? Kedụ ihe ndị gọvanọ n'ala ịgbọ merela n'alaigbo? ""Ndigbo kwesiri ibu ụzọ mezie Alaigbo tupu e kwuwa okwu nnwereonwe Biafra."" Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị ọzọ Igwe onye bụ nwafọ Ụmụọmakụ n'Orumba-South, Anambara steeti tinyere ọnụ: Kedụ ihe Noble Igwe na-arụ? ""A gụrụ m akwụkwọ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka', gaa fee ala nna m na Gombe steeti ebe m kuziiri ụmụakwụkwọ, rụọ ọrụ na Virgin Nigeria bido n'afọ 2005 rue 2010, mechaa bido ụlọọrụ nke a kpọrọ '360 Group.'"" Isonye ihe na-eme n'ala Igbo ""Kedụ ndị ga-emepe ala Igbo ma ọ bụrụ na ị naghị alaru ala Igbo?"" ""Ọ dị mkpa ka onye Igbo na-alaru ụlọ. Ị gaa Igbo ị wetuo onwe gị ala, gị na ụmụnna gị akpaa nkata, a mara ihe dị mkpa a ga-eme were dozie Igbo."" Imụ nwa na anụghị di maọbụ nwaanyị (Babymama) Igwe kwuru na ihe kpatara ya bụ na ụfọdụ na-echezi na omenala adịghịzị mkpa. ""Ụmụnwaanyị na-ekwuzi na ha achọghịzi ịbụ oriakụ, mana agbachaa ọsọ agụ ọ ""mile"" Igwe kpọrọ oku ka ụmụ Igbo na-ala obodo ""ọ bụrụgodu otu ugboro n'afọ ịgbaa mbọ na-ala."" Mkpagbu n'alụmdinanwunye ""Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị a na-emegbu gị, laa be nna gị. Ị bụrụ nwoke, nwunye gị na-emegbu gị, laa be nne gị."" Noble Igwe : N'obodo Igbo niile, ụmụada kacha nwee ike Asụsụ Igbo ""Nwa ọbụla m mụrụ ga-asụ Igbo. Ị sụghị Igbo, ị gaa chọọ be nna gị. ""Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ị sụọ Bekee, inweta ugwu. Mana ọ bụ ị gbaa mbọ, i nweta ugwu."" Ị sụọ Igbo, i gosi na i ji ebe i si eme ọnụ, igosi anyị na-ezo ala Igbo, sọsọ ihe a ga na-anụ bụ akwụ ọgwụ nwere enweta ego."" O nwere ndị amaghị na ịgba mbọ, ị bụrụ onye ọbụla ịchọrọ ị bụ."" Ọkwa ụmụada n'Ala Igbo ""N'obodo Igbo niile, ụmụada kacha nwee ike. Ha sị na a gaghị eli ozu, agaghị eli ozu ahụ."" Lee ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44333706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44333706,Inec: Bia were 'PVC' gị,Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) kwuru na ha akpọọla oku ka ndị debanyere aha ha n'afọ 2017 gaa nara akwụkwọ ntuliaka(PVC.),"Inec: Bia nara PVC gị Inec kwuru na akwụkwọ ndị tinyere aha ha maka ntuliaka bido n'ọwa Epreelụ rue Disemba afọ 2017 adịla maka mwere n'ụlọọrụ ha dị n'ọkpụrụọchịchị dị iche iche n'ala anyị. Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC na onye Komishọna na Rivas steeti bụ Obo Effanga sị: ""Anyị ebidola inye PVC. Akwụkwọ ndị niile tinyere aha ọhụrụ, ndị si ebe ha bi kwara gaa ebe ọzọ, ndị nke ha furu efu maọbụ mebie emebi maọbụ ndị asụpetaghị aha ha nke ọma maọbụ aha ha gbanwere, adịla."" Effanga gara n'ihu kwuo na dịka iwere akwụkwọ ntuliaka na-aga n'ihu, na ndebanye aha ka dịkwa ire. Ka ọ dị ugbua ọtụtụ ndị ọnụ na-erụ n'okwu dịka onyeisiala Muhammadụ Buhari na onyeisi ụlọomeiwu Sineti bụ Bukola Saraki ekwuola mkpa ọ dị ka onye ọbụla ga were PVC ya iji kwupụta onye ha chọrọ ka ọ banye n'ọchịchị n'igwe okwu Twitter. Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi obi mwute na ọtụtụ ndị Naijiria akpọghị idebanye aha maka ntuliaka maọbụ iweta PVC ọrụ kama ha ji ọnụ ụkpọrọ atụ votu na Twitter Cheta bidọ n'ọnwa April afọ gara aga, Inec nyere ohere ka ndị toruola afọ iri na-asatọ debanyere aha ha n'afọ iji nata akwụkwọ ikike isonye na ntuliaka(PVC.) Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53524593,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53524593,"Skincare: Ọ bụrụ na ahụ gị na-akpọ nkụ, lekwa ihe ị ga-eme were tinye ndụ n'ime ya",Ọtụtụ mmadụ na-achọ ka ahụ ha kwụọ mụrụmụrụ makana ọ bụ otu ụzọ esi ama onye mara mma.,"Nke mere na ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịhụ na anụ ahụ ha mara mma n'anya. Nchọcha BBC mere gosiri na mmetọ ikuku Bekee kpọrọ ""pollution"" so n'ihe na-eme ka ahụ mmadụ ghara ịna akwọ mụrụ mụrụ. Ihe ọzọ bụ ajọ ude nakwa ihe otite ndị ọzọ, nri nakwa ahụike onye ahụ. E nwekwara ebumpụtaụwa ihe ndị ọzọ na-esokwa ebute mgbanwe n'ahụ mmadụ dịka nka. Ihu nhịkọ maọbụ akara nka Bekee kpọrọ ""wrinkles"" so na ebumpụtaụwa nke onweghị ihe ihere dị na ya. Mana ọ bụrụ na nsogbu gị bụ ahụ gị ịkwọ mụrụmụrụ, lekwa ihe ndị ị ga-etinye anya na ya. Mgbe BBC kpọtụụrụ ọkammụta gbasara nlekọta akpụkpọ ahụ na UNTH Enugwu bụ Ọkammụta Uche Ojinmah ka ọ waa anyị anya maka nke a. Gere ọnụokwu Dọkịnta Uche Ojinmah Ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ? Lee ihe 8 ị ga-eme. Ọ kọwara na akpụkpọ ahụ mmadụ niile abụghị ofu. Ebe ọ dị mfe ịme ka ụfọdụ kwọọ mụrụmụrụ ozugbo, ọ na-ara ndị ụfọdụ ahụ. Ebe ụfọdụ sị n'afọ dị mma, ụfọdụ kwesiri ịlekọta anya. O kwuru na ahụike mmadụ na-egosikwa na ahụ ya maka ọbara adịghị n'ahụ, okpo maọbụ ịba nwereike ịme ka anụ ahụ mmadụ dị njọ. Ihe ndị ị kwesiri ị na-eme mgbe niile Otu i si ebi ndụ na-emetuta ahụike gị dịka o si emetụkwa anụahụ gị. Ihe ndị a anyị ga-agụpụta ga-enye aka ịme ka ahụ gị na-akwọ mụrụmụrụ, dịka Ojinmah na dị ọkachamara ndị ọzọ kwekọrịtara: 1) Na-aṅụ mmiri nke ọma Ọ bụ eziokwu na odosighi anya ka ịṅụ mmiri si ebute ahụ ịkwọ mụrụmụrụ mana mmụta gosiri na ịṅụ mmiri nke ọma na-eme ka ahụ mmadụ na-akwọ mụrụmụrụ. Ịṅụ mmiri na-eme ka ahụ mmadụ na-adọ adọ, mee ka ọ ghara ịkpọ oke nkụ maọbụ dị njọ n'anya. Ojinmah kwere na ịṅụ mmiri na enyeaka n'ịdozi ahụ mmadụ. 2) Iri nri na-edozi ahụ Nri na-edozi ahụ na-egbochi anụahụ ịka nka ọsịsọ. Nri ndị a gụnyere akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi na azụ salmọnụ. Nchọcha gosikwara na-ịṅụ mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ Bekee kpọrọ 'probiotics' nwekwaraike itinye ezigbo nje na-egbu nkwọ, ọkọ pimpụl maọbụ ahụ mgbachụ sitere n'anwụ. 3) Ịmegharị ahụ (Exercise) Nchọcha emere na mmadụ nakwa ahụ anụọhịa gosiri na ịmegharị ahụ n'ụdị ga-eme ka ikuku ndụ bata mmadụ n'ahụ Bekee kpọrọ aerobics na-eme ka anụahụ mmadụ dị mma. Ọ na-eme ka elụahụ mmadụ ghara isiike ma mee ka ime ahụ onye ahụ sie ike. Nka na-ebugharị ọnọdụ a, mee ka eluahụ sie ike ma mekwa ka imeahụ ghara isiike. Nke a na-eme ka ahụ onye ahụ dị mma anya ma dịkwa ka nke nwata. 4) Ịrahụ ụra nke ọma Nke a ga-abụ ihe mmgbagwoju anya nye ụfọdụ, mana nke bụ eziokwu bụ na ụra na-edozi ahụ mmadụ. Ahụ mmadụ na-edozi onwe ya mgbe onye ahụ nọ n'ụra. Ọ na-enyekwa aka ọbara ikwo nke ọma n'ahụ ma meekwa ka ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ dịka nke Bekee kpọrọ Collagen. Ọ bụ ihe nwereike ịmezi ahụ anwụ chagburu maọbụ mee ka ahụ nhịkọ belata. 5) Igbochi anwụ ịcha gị n'ahụ Oke anwụ na-agbachu mmadụ ahụ ma na-ebutekwa ahụ ịkpọnkụ, nka mberede maọbụ ọrịa kansa anụahụ. Na-ete ude gana ekpuchi ahụ gị anwụ Bekee kpọrọ sunscreen, gbaara oke anwụ ọsọ ma kpuchikwaa ahụ gị. Nchọcha gosiri na mmadụ ịgba onwe ya n'anwụ mgbe niile dị njọ karịa anwụ ịcha onye ahụ. Gbaara ya ọsọ. 6) Esekwala anwụrụ Anwụrụ sịga, nke e sere ese maọbụ nke kusara mmadụ n'ahụ nwereike ibutere onye ahụ nka mberede, ihu nhịkọ maọbụ ọrịa anụahụ dịka ọkụ maọbụ akpụkpa. Ọ na-emekwa na anụahụ onye ahụ agaghị agwọli onwe ya. Gbaa mbọ kwụsị ịse sịga maọbụ anwụrụike ndị ọzọ. 7) Ịṅụ oke mmanya Nọchacha gosiri na ịṅụ oke mmanya na-eme ka anụahụ mmadụ hịkọọ. Ịṅụ oke mmanya na-emekwa ka mmiri taa mmadụ n'ahụ nke na-ebutekwa ahụ nhịkọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụmụru, ị ga-ebeleta oke mmanya. Ihe ndị gboo ji achọ mma Ojinmah kwuru na ọtụtụ ihe ndị gboo ji achọ mma anaghị emeru mmadụ ahụ maka na ha bụ ọnatara chi. Ọ sị na nzụ na-eme ka mmiri dị n'akpụkpọ ahụ, na ajụkwa anụ ahụ oyi, ma mee ka ọkọ benata n'ahụ. O kwuru na ""Uhie bụ maka naanị ịchọ mma. Ọnweghị ihe ọzọ ọ na-eme"". Ube Bekee nwere ụmụ ihe dịcha n'ime ya na-enyeaka aka ka anụ ahụ ọhụrụ na-apụta. Ojinmah kwetere na ube Bekee nwere ụmụ vitamin dị na ya na-edozikwa ahụ. Mana ọ dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla na-ego mmanụ akị, ube na ụmụ akụkụ (Plant) ndị ọzọ kpachara anya maka adịgboroja. Ọ dọrọ aka na ntị a maka ndị na-ego ""organic"" bụ nke ọ sị na ka e si eme ụfọdụ n'ime ha ezighị ezi. Ọ sị na ndị nje bara nwereike ibute ọrịa ndị ọzọ atụghị anya. Ihe ndị ọzọ ị ga na-eme Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-44639518,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44639518,Ndị Super Eagles dịzị ka nwunye ọhụrụ a chọrọ ịlụ,"Iko mbaụwa bụ emume kachasị nwe ugwu n'egwụregwụ bọọlụ n'ụwa niile, ma bụkwara ebe ndị ọgba bọọlụ na-egosi akaraka ha i ji nweta ọganihu pụrụiche.","Oghenekaro Etebo na onye otu ya Ahmed Musa bụ ndị na-agbara 'Super Eagles' Naịjirịa bọọlụ. Agbanyeghi na Naịjirịa apụọla n'asọmpi a, ndị egwuregwu Naịjirịa abụọ nwetere ezigbo ugwu nke mere aha ha ji na-ada ụda na soshal midia. Mmadu abụọ n'ime ndị a bụ Ahmed Musa na Etebo Oghenekaro. Etebo dere n'akara Twitter ya na asọmpi ndị Super Eagles na Ajentina gbara bu nke kachasị siere ya ike kemgbe o bidoro egwuregwu bọọlụ. End of Twitter post, 1 Nke mere ndi mmadu jiri nye ya ezigbote ekele. Dika Nnamdi Mbonu kwuru na etu nwaamadị a si gbaa bọọlụ pụrụiche ma kwukwa na ọtụtụ ndị Naịjirịa kwenyere na ihe a okwuru. Mana, Alan Shore nwere akara Twitter @Lawyerchap si na ọ dị ya ka Etebo omere ngwa ngwa mgbe ọ gara binye aka n'otu egwuregwu bọọlụ Stoke City. Ma juọ ma ọ ga aka mma ma ọ bụrụ na o mere etu a ka agbachara Iko Mbaụwa. Onye nwere akara @Tslamdr si na ọ bụ ihe o ma na ọ gara Stoke City, maka na ya mee nke ọma, ndi ọzọ ga-azụrụ ya ngwa ngwa. Onye nkwado Stoke City bụ Liam Clowes kwenyere n'ihe @Tslamdr kwuru maka na ọ sịrị na Etebo ga-enyere ha aka banye Champịọns League. @Chris26Hughes si na Etebo mere ọfuma n'iko Mbaụwa, nke mere ya na-eche ịhụ ya na Stoke City. Mana, ka ndị na-akwado Stoke City na-enwe aṅụrị maka Etebo, ndị Galatasaray na-akpo Ahmed Musa ka ọ bịa bụrụ onye otu bọọlụ ha. Musa dere na ọ na-ekele ndị niile nyere ya nkwado ma Chukwu nyere ya ohere ị ga Iko Mbaụwa. Dịka ndị mmadụ ka na-ezigara ya ozi ekele pụrụiche, ndị nkwado Galatasaray bụ otu egwuregwu dị na Tọọkị webatara ozi n'akara Twitter ya, sị ya bịawa otu ha. Amabeghị ma Musa ọ ga aza oku a, mana o gosiri na ọ bụ onye eji aga ọgụ n'Iko Mbaụwa." afirika-55102261,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55102261,Asuu strike: Ndị nkuzi mahadum sị na mkparịtaụka ha na gọọmentị gara ọfụma,"Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị nkuzi mahadum Bekee kpọrọ ""Academic Staff Union of Universities"" (Asuu) na gọọmentị Naịjirịa nwerela nkwekọrịta n'ime ihe asatọ ha na-arịọ gọọmentị.","Na ngwụcha nzukọ ha mere awa asatọ, Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige sị na obi dị ya mma etu okwu siir gaa. Ngige sị na he kwenyere n'ihe Asuu kwuru, ma kwuo na ihe fọrọ bụ ka Asuu gaghachi gwa ndị otu ha nkwekọrịta e nwere. Onyeisi Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwenyere na nzukọ ha gara nke ọma ma kwụọ na o nwere ihe ọhụrụ ha ga-eburu ga gwa ndị ọzọ tupu ha alachite n'ihu gọọmentị. Ọ bụ kemgbe ụbọchị 9 nke Maachị 2020 ka Asuu malitere abụbụ ọrụ a. Ọ bụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ ka Asuu ji eme abụbụ ọrụ - Ọkammụta Aribodo Ọkammụta Dennis Aribodo bụ ọkammụta n'ihe banyere ahụike ọha na nje na mahadum Azikiwe di n'Ọka gwara BBC na okwu abụbụ ọrụ Asuu gbara bụ maka ọdịmma mahadum nakwa ndị na-agụ akwụkwọ n'ime ya. Ọkammụta Aribodo si na ọ bụ eziokwu na ụmụakwụkwọ na-atamu maka etu ha jiri nọdụ n'ụlo kemgbe ọnwa asatọ mana ọ bụ maka ha ka ha jiri na-eme abụbụ ọrụ. Ọ sị ""Ọ bụ maka ọ dị mma ụmụakwụkwọ ka anyị jiri eme ihe a anyị na-eme. Mu onwe m, ụmụ m abụo nọ mahadum ma na-agabiga ihe a."" Ọkammụta Abribodo sị na ọ bụ ewete ego a ga-eji hazie mahadum ọfụma ka ụmụakwụkwọ ga-enwete ohere ịgụ akwụkwọ ọfụma. Ọ sị ""A na-asị na anyị nwere ụmụakwụkwọ dị ""half-baked"", mana ya bụrụ na mahadum enweghị ihe e ji azụ ụmụakwụkwọ kedụ ihe mere ha ejighị adị ka ha eghere eghe."" Nkwa gọọmentị kwere Asuu Dịka gọọmentị kwere nkwa na ọ ga-enye ndị Asuu ijeri naịra iri isii na ise iji hụ na ha kwụsịrị abụbụ ọrụ a, Ọkammụta Aribodo sịrị na ego ahụ achịtaghị aja ma ncha. Ọ sị: ""N'afọ 2013, gọọmentị Goodluck Jonathan kwenyere na ọ ga-enye Asuu ijeri narị naịra abụọ kwa afọ. Ha jikwa anyị ihe a kpọrọ ""Earned Academic Allowances"" (EAA) pụtara ijeri narị naịra anọ na otu (400b) n'afọ 2018. Nke pụtara na a na-ele ijere naịra iri isii na ise anya, onweghi ebe ọ gara ma ncha."" O kwukwara na n'ime ego a gọọmentị sị na ọ ga-enye, ijeri naịra iri anọ bụ nke e ji ha n'ụgwọ site n'afọ 2013. ""Ewepu ego ahụ n'ime nke ha kwere nkwa na ha ga-enye ugbua, ọ fọdụ ijeri naịra iri abuọ n'ise. ijeri naịra iri abụo n'ise mahadum karịrị 70 ga-eke."" 'Gọọmentị eweghị agụmakwụkwọ wee mkpa' Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ọkammụta Aribodo sị na ihe mere Asuu jiri kwụsie ike bụ makana ha na-ahụ eme gọọmentị na-enye ngalaba ndị ọzọ enyemaka. Ọ sị: ""Gọọmentị nyere ndị ọkụ latrịk aka, nye ndị ụlọakụ. Ndị niile bụ ụlọọrụ ndị nkịtị nwe, mana ya ruo n'okwu akwụkwọ, a sị na ego adịghị."" 'Ọ bụghị maka IPPIS ka anyi jiri nọdụ abụbụ ọrụ' Nwata akwụkwọ na-asụ asụsu ọtụtụ Dịka ọfụdụ ndị mmadụ na-ekwu, ọ bụ maka atụmatụ ""Integrated Payroll and Personnel Information System"" (IPPIS) gọọmentị hibere iji na-akwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ mere Asuu jiri na-eme abụbụ ọrụ. Mana Ọkammụta Aribodo sị na ha nọbu n'abụbụ ọrụ nke ịdọ aka na ntị tupu gọọmentị ewepụte IPPIS. Ọ sị: ""Ọ bụghị maka ihe mere anyị jiri nọdụ abụbụ ọrụ, mana anyị nwekwara ihe na-arụ ọrụ dịka ya anyị hibere nke gọọmentị nwereike iji na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ."" Ọ sị na otu ihe mere ha ji agbajọ IPPIS bụ makana ụfọdụ mmadụ anaghị enwete ụgwọ ọnwa ha maka IPPIS a. Nkwekọrịta gọọmentị na Asuu nwere bụ na a ga-ewepu ha na IPPIS na nwamgbenta. Okammụta Aribodo boro ebubo na IPPIS abụghị nke Naịjirịa mana ASUU wetere nke ha bụ ""Transparency and Accountability Solution"" (UTAS). Ka ọ kwụ ugbua, Ọkammụta Aribodo sị na ha na gọọmentị nwere mkaprịtaụka na Fraịde bụ ụbọchị 27 nke afọ 2020, bụ oge ha ga-amara etu eke ga-esi nyaa anwụ." 42789073,https://www.bbc.com/igbo/42789073,Trump ga-aza ajụjụ maka ịhe nrụrụaka eboro ya gbasara Russia,Onyeisiala mba United State bụ Donald Trump ekwetala na a ga agba ya ajụjụ ọnụ maka ịhe nrụrụaka a na-ebo ya n'ihe gbasara ndị Russia ị tinye aka na mmeri o meriri na-ntuliaka dịka onye isiala mba America.,"Trump Sịzị sị mewe ngwangwa bia gbaa ya ajụjụ ọnụ maka ebubo a na-ebo ya Prezident Trump sịrị na ọ na-atu anya na-onye isi ndị Justice Department bụ Robert Mueller ga agba ya ajụjụ ọnụ n'ịme izu uka abụọ ma ọ bụ atọ n'abia. Ọ sịkwa na ya ""na-atụ anya ka eme ya ngwangwa"". Trump sịbụ na ya echeghị na Mueller ga agba ya ajụjụ ọnụ. Ọ sịbụ na ya bụ ị gba ajụjụ ọnụ bụ ""nkata ndị ịro na-akpa"" megide ya. Ugbua Trump na-ekwusị ike na ya dị nkwadebe maka ya bụ ajụjụ ọnụ ma edoo ya na-iyi. Cheta na ndị ọrụ US na-eme nchọpụta akpọrọ intelligent agencies kwenyere na aka ndị Russia dị na-mmerị Trump meriri Hillary Clinton na ntuliaka mba US. Nchọpụta e megoro na ya bụ okwu Ka ọ dị ugbua, a maala mmadụ anọ ikpe bụ ndị a chọpụtara an-aka ha dị na ya bụ mpụ. Onye mbụ ejidere bụ Michael Flynn bụ onye ọrụ achụrụachụ na-enyere Trump aka maka nchekwa obodo. Flynn tụụrụ ndị FBI asị na ya amaghị ịhe gbasara mmekọ ndị Russia na-ntuliaka nke USA. Mana ọ mechara kweta. Ọ yọwakwara biko ka e mere ya ebere ka ya nyere ha aka n'ime ya bụ nchọpụta. Onye ọzọ a chọpụtakwara aka ya dị na ya bụ okwu bụ nwa Trump bụ Donald Jr a sị na ya na onye Okaikpe ndị Russia mekọrọ mgbe nna ya na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị. George Papadopoulos bụ otu n'ime ndị ndụmọdụ Trump kwetakwara na ya tụọrọ FBI asị maka ya bụ aka enwe n'ofe ndị America. Ndị ọzọ a na-enyocha bụ ọgọ Trump bụ Jared Kushner nakwa Paul Manafort bụ onye a na-ebo n'onwere ka ya na ego siri ga, mana okwua agbasaghị ntuliaka emere n'America." afirika-46003495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46003495,Nnamdi Kanu: Ihe gbara ọkpụrụkpụ n'okwu ya,Onye ndu IPOB Nnamdi Kanu mere mgbasa ozi nke abụọ ya n'igwe Redio taa kamgbe ọ pụtagharịrị ihe ọzọ.,"Na mgbasa ozi a bụ nke ọ malitere site na ị nabata ndị otu IPOB na ndị ọzọ na-ege ya ntị. O kelere onye bụbu minista ụgbọelu bụ Fani Kayode na onye bụbu gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose na mbọ ha na-agba n'ikwupụta uche ha na Naịjirịa. Nnamdị Kanu n'okwu ya sị na ọ bụ ihe pụrụiche ị bụ onye Biafra karịsịa onye otu IPOB ma too ndị nille ka nwere ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ. O kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anwụọla kamgbe ihe karịrị otu afọ na onye na-anọchi anya ya ugbua bụ onye akpọrọ Jubril si na mba Sudan. Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Ọ gara n'ihe kwuo na ọ ga-eme emume n'ọnwa ọzọ bụ ebe ọ ga-egosi onyonyo ga-ekpuhe eziokwu banyere ọnwụ Buhari na nnọchi Jubril. Kanu boro ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ na Ohanaeze Ndigbo ebubo na ha kpara nkata ka e gbuo ya na ndị otu IPOB. Kanu kwuru na ya ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ kwesiri inwe mkparịta ụka n'ime ọnwa Seputemba ahụ awakporo ụlọ ya. Nnamdi Kanu kwuru na ihe Dave Umahi gwara BBC Igbo bụ eziokwu, o kwuru na ọ gwara Umahi gaa wetara ya ihe n'Abuja mana ọ gbara aka lọta. O kwuru na ihe ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ maara bụ naanị akpa ha karịa ọ dị mma ndị Igbo. IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta Kanu kwuru na ọ bụ onye akpọrọ Ango Abdulahi na ndị Fulani ndị ọzọ magidere ndị ndu ọwụwanyanwụ ka ha machie IPOB. Ọ gara n'ihu katọọ nwụchi anwụchiri ndị ụmụnwaanyị IPOB n'Owerri na onweghi onye nwere ike ikwu okwu n'ala Igbo banyere nke a. Kanu kwuru na Ohanaeze ndigbo ga-anọ na ""mmachi"" gọọmentị etiti nyere ha dịka ndị ohu nke bụ na ha enweghi ihe ọbụla ha ga-emeli na Naịjirịa. Kanu katọrọ gọọmentị Naịjirịa maka nnupuisi n'iwu na-achị obodo bụ nke o kwuru pụtara ihe n'ọchịchị dị ugbua. O kwuru na ndị ọchịchị Naịjirịa chọrọ imechi ihe niile gbasara IPOB na nwereonwe Biafra site n'ụzọ ịkpachi ego na ihe ndị ọzọ. N'ikpeazụ Kanu kwuru na IPOB ka kwụsi ike na agaghị enwe ntuliaka ọbụla na mpaghara ọwụwanyanwụ n'afọ 2019. Gee onu Nnamdị Kanụ na Sụpirisụpiri Gee ọnụ okwu Nnamdi Kanu na sụpirisupiri Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44200151,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44200151,UAE na-enyezị ndị mmadụ visa afọ iri,Ndị isi ọchịchị mba United Arab Emirates na-enye ndị mmadụ akwụkwọ Visa afọ iri maka mmepe ụlọọrụ na azụmaahịa.,"Ọkparaeze obodo Dubaị Ndị ha nyere ohere a gụnyere ndị dọkịta, ndị njinia, ndị nrụpụta ihe ọhụrụ na ndị oji ego achụ ego. Ezinaụlọ ndị a nakwa ụmụakwụkwọ na eme nkeọma ga-enwete kwa ohere visa afọ iri ahụ. Ndị isi ọchịchị mba UAE Ozi a si n'akara twitter ọkparaeze mba Dubaị na Praịm mịnịsta mba UAE bụ HH Sheikh Mohammed ụnyaahụ mgbe ha mechara mkparịta ụka ndị isi ọchịchị. Ọ gara n'ihu kwuo na ndị oji ego achụ ego ga-enwe ohere i mepe ma nwere ụlọọrụ nke ha kpam kpam. Osote onyeisiala mba UAE enyela ụlọorụ na-ahụ maka visa ka ha tinye iwe n'ọrụ n'ọgụgụ afọ a. Iwu a ga-enye ụmụakwụkwọ ohere i bi na UAE ma ha gụchaa akwụkwọ ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50612733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50612733,Jesus manger: E weghachịtala osisi si n'akwa Jesus dinara n'ime ya,E weghachịtela osisi ha na-ekwu si n'akwa ahụ Jesus dinara n'ime ya mgbe a mụrụ ya na Bethlehem.,"E gosiputara osisi ahụ n'ebe a ga-agba ya nkiri na Jerusalem, tupu e were ya gaa Bethlehem Poopu Francis nyere iwu ka e si na Basilica nke Santa Maria Maggiore dị na Rome, welaa osisi ahụ nọrọla ihe karịrị afọ puku, nye ndị Bethlehem. Enugwu ga-enwe ezi nchekwa - Ndị uweojii Kọmishọna uweojii Enugwu steeti bụ Ahmad Abdurahman, ekwuola na ndị otu ya dị ezigbo njikere ịhụ na steeti ahụ nwere nchekwa pụrụiche ọkachasị ugbua oge ekeresimesi ruru nso. O kwuru na ha ewepụtala atụmatụ dị iche iche ga-enyere aka ịhụ na ha chekwara steeti ahụ nke ọma. E gbuola ndị Boko Haram 13 Ndịagha Naịjirịa ekwuputala etu ha si buso ndị oyindụegwu bụ Boko Haram agha na nso osimiri Kamadougou ma gbuo mmadụ iri na atọ n'ime ha. Ha kwukwara na ha nwetara ngwaagha gụnyere ụgbọegbe atọ, egbe na-esi n'ikuku nakwa ọtụtụ mgbọegbe na ọgbatumtum, n'aka ha. N'egwuregwu, Real Madrid emechaala gbagoruo n'elu tebulu La Liga dịka ha ji goolu abụọ a satara otu merie Alaves. Ka ọ dị ugbua, ha ji naanị pọịntị atọ aga ndị nọbụ n'isi bụ Barcelona. Atilogwu Udo: Ndị agha na-azacha ụzọ n'Owere Ọchị agha Yusuf Tukura na ndị otu ya Ọchịagha Yusuf Tukura bụ aka na-chị ọdọ ndị agha Bekee kpọrọ 34 Artillary Brigade n'Owere chị ndị otu ya wụba ụzọ obodo ahụ n'ụtụtụ Satọde ime mkpocha na nzacha. Ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụzọ Egbu Ọchị agha Tukura si na ha mere ihe a iji mezuo ihe onyeisi ha bu Ọchịagha Buratai si ha mee iji mee ka ha na ndi nkịtị nọdụ n'udo Ọ sịkwa na atụmatu Atilogwu Udo ha na-eme na-aga nke ọfụma Anyị enyeghi P&ID ego n'aka - Malami Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Ọkaiwu ukwu nke Naịjirịa bu Abubakar Malami ekwuola na ọbụghị ego ka ha nyere ụlọikpe dị na mba Briten maka okwu ha na ụlọọrụ P&ID. Malami si na ọ bụ nkwekọrịta na-aga akwụ ya bụ ego dị nde narị naịra abụọ ka ya nyere ụlọikpe. Ọ sị na etu ọ kwụ ugbua, ya bụrụ na Naịjirịa emeri n'ikpe a, ha agaghi enyezi P&ID ya bụ ego. Ngagharịiwe Hong Kong Ụmụ akwụkwọ sekọneri na ndị nara ezumike nka na-eme ngaghri iwe na Obodo Hong Kong n'ụbọchị Satọde bụ ụbọchị mbụ n'atụmatụ ngagharị iwe a chọro ime kwa ngụcha izu ụka maka ihe ha sị bụ oke aka ike ndị uweojii. Ljungberg abụrụla onye ndụ Arsenal nwamgbenta Otu egwuregwu Arsenal ahọpụtara Freddie Ljungberg dịka onye ga-anọchite anya Unai Emery dịka onye nchuzi ha. Ljungberg ga-ano n'ọkwa ahu nwamgbenta ruo mgbe ha nwetere onye ọhụrụ. Aisha Buhari sị na nsogbu dị na Naịjirịa akarịala Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Aisha Buhari etiela mkpu na ihe isi ike akarịala na Naịjirịa ma sịkwa ka ndị na-achị hụ na ha mere ihe ha kwesiri ime ma hụ na ahụhụ ndị ọha na-ata belatala. Odoziakụ Buhari kwuru nke a n'Abuja n'ebe a na-eme ọgbakọ ngalaba ofufe Alakuba akpọrọ ""Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) General Assembly and National Executive Council"" emere ụnyaahụ. Buhari si n'agbanyeghi na di ya bu onyeisiala sọsọ ya agaghi emenwu ihe dị na ọchịchị. Ọ sị ka ndị so achị Naịjirịa tinye aka n'atụmatụ ịzọpụta Naịjirịa na nsogbu. Ọ gakwara n'ihu gbarụọrụ aka na-achi steeti di iche iche ihu maka ọ sị na ha kwesiri itinye uche n'ihu na ha na-achị nwetere ihe ọganihu. Odoziakụ Buhari nọkwa na ọgbakọ ahụ tinye ọnụ n'atụmatụ inyocha ihe ndị mmadụ na-eme na soshal midia. ""Maka okwu soshal midia, ị gaghị anọdị na be gị dee na Osote Onyeisiala Naịjirịa arituola n'ọkwa. Ihe bụ nnukwu okwu. Ya bụrụ na Chaịna nwere mmadụ na-enyocha ihe ndị mmadu ijere na ọma na-eme na Soshal midi, ahụghị m ihe mere na Naịjirịa nwere mmadụ otu narị nde na iri asatọ agaghi emenwu ya."" Anyị amalitela ibu ndi mmadụ n'efu n'ime ụgbọoloko si Legọs gawa Ibadan - Amaechi Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi kwuru na ngalaba ya amalitela iji ụgbọ oloko buo ndị mmadụ n'efu site Legọs gawa Ibadan. Atụmatụ a malitere ụnyaahụ ga na-agakwa n'ihu ruo ngụcha ọnwa Maachị nke afọ 2020. Gọọmentị Imo na ndị uweojii ga-arụkọ ọrụ inyocha akwụkwọ ụgbọala na Decemba N'Imo steeti ndị uweojii sị na ha na ngalaba na-ahụ maka ibulite ego dị n'akpa gọọmentị state ahụ ga esoro mee emume ha kpọrọ ""operation Vede na Bekee. Operation Vede bụ atumatu ha ga-eji nyocha ma akwụkwọ ụgbọala ezukwara ezu. Atụmatu ga-amalite n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Decemba. Onye gburu ndị mmadụ na London si mkpọrọ pụta - uweojii What happened at London Bridge stabbing incident? Onye ji mma mmagbuo mmadụ abụọma merụọ mmadụ atọ ahụ ụnyaahụ na akwa mmiri London bụ onye amara ikpe na ya na ndị oyi ndụ egwu nwere mmekọ Ndị uweojii sị na Usman Khan dị afọ iri abụọ na asatọ ka si mkpọrọ pụta mgbe ọkpara mkpa mkpa a. Ndị uweojii gbagburu amadị a dịka ndi ọha jituru ya ebe ọ na-akpa ike a. Gee akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-43496097,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43496097,Nsogbu 9mobile: Teleology akwụọla nde $50 iji zụta,Teleology Holdings ritere uru ị bụ ndị nwere isiọma izụ 9mobile n'ụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a.,"Teleology meriri Glo, Airtel na Alheri iji nweta ohere izụ 9mobile Enyere ụbọchị taa ka ha kwụnye ego ahụ, maọbụrụ na ha akwụnwụ ya, a ga-akpọ ụlọọrụ, Smile Telecoms Holdings, ka ha wegharịa 9mobile. Dịka Teleology kwurula ego nke mbụ, a na-atụ anya na ha kwụ nke fọrọnụ bụ nde $500 n'ime ọnwa atọ na-abịa iji nwere 9mobile kpamkpam. Akụkọ kwuru na Teleology si na Keystone Bank kwụọ nde $50, ebe United Capital Trustees Ltd na United Bank for Africa (UBA) Plc ga-erite uru na ya. Teleology meriri ụlọọrụ ekwenti dịka Bharti Airtel, Globacom na Alheri nke Dangote nwe iji nweta ikikere ịzụ 9Mobile. Akụkọ ga-amasị gị: Onye bụbụ onyeisi MTN na Naịjirịa mabụrụ onye du ndị Teleology tinye ọnụ n'okwu ịzụ 9mobile bụ Adrian Wood kwara ụlọ akụkọ Thisday na ndị otu ya nwetara ego ahụ ma kwụnye ya na ụlọakụ United Capital Trustees na UBA. Wood kọwara na ndị niile ọ gbasara etinyela aka n'akwụkwọ. ""Dika etinyerela aka n'akwụkwọ mbibi a gbara, Teleology ga-akwụghachị ụgwọ 9mobile iji ụlọakụ iri na atọ, ebe ha ga-enye ya atụmatụ ịkwụghachị ha. ""Nke a pụtara na 9mobile agaghị enwekwa ụgwọ ọbụla n'akwụkwọ ha n'ihi na Teleology akwụchala ha niile. Nke a pụtara na 9mobile ga-enwe ụgwọ mbibi dịka onye so nwere oke n'ụlọọrụ ahụ.""" mba-uba-44191873,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44191873,Onweghi onye Naịjirịa so na kadịnal 14 Pope wepụtara,Pope Francis nọọrọ n'ụbọchị ụka taa họrọ ndị ga-abụ kadịnal ọhụrụ nke ụka Katọlik mana onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla aha so.,"Ezigbo aha Pope Francis bụ Jorge Mario Bergoglio Pope kwupụtara nke a na-atụghị anya ndị mmadụ dịka ọ na-agwa ndị njem alansọ okwu. Ndị a akpọpụtara aha ha ga-eso họpụta onye Pope ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha agaghị afọ iri asatọ mgbe oge ahụ ruru. N'oge mbụ ụmụ afọ Naịjirịa anọ abụrụla kadịnal, ndị dịka Dominic Ignatius Ekandem, Francis Arinze, Olubunmi Okogie na John Olorunfemi. Ndị a akpọpụtara aha ha ga-eso họpụta onye Pope ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha agaghị afọ iri asatọ mgbe oge ahụ ruru. Mana n'ime mmadụ iri na anọ ndị a akpọrọ aha ugbu a, onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla so na ya. Ndị kadịnal a gụnyere Archbishop Konrad Krajewski nke Poland, Angelo De Donatis , Luis Ladaria, Giovanni Becciu, Louis Raphael I. Sako, Pedro Barreto, Desire Tsarahazana na ndị ọzọ. A ga-edu ndị a n'iyi ọrụ n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45708209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45708209,Massob: Ihe anyị ejighị chọọ ka a tụnyere Bianca Ojukwu,"Ndị otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Movement for the Actualization of Sovereign State of Biafra, (MASSOB) akpọọla ndị APGA oku ka ha ghara ịtụnyere Bianca na ntuliaka imeụlọ ha na-abịa.","Bianca Ojukwu na-azọ ịnọchite Anambra-South na Sineti nn'aha otu APGA N'ozi mgbasaozi otu Massob wepụtara nke onyeisi ha bụ Uche Madu binyere aka, ha kwuru na ọ bụ ihe mkparị ma Bianca Ojukwu banye na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha kwuru na Bianca banye n'ụlọoimeiwu, na ọ ga-enye ohere ka ndị omeiwu ndị ugwu ndị anaghị akwanyere Ojukwu ugwu nwe ohere inye ya mkparị dịka e nyere nwunye Bola Tinubu. ""N'ihi ezi ugwu Ndigbo na-akwanyere Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, nwunye ya, Iyom Bianca ekwesighị ịbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị. ""Dịka nwunye Eze Igbo Gburugburu, Iyom Bianca Ojukwu nọ ka nne Ndigbo onye ikwụba aka ọtọ, ebube na ugwu ya ga-emetọ ma ọ bụrụ na o tinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị."" Otu ahụ kwuru na ha hụrụ nwunye Dim Odumegwu Ojukwu n'anya dịka onye na-anọchite anya Ndịgbo n'ihe niile, gara n'ihu sị, 'Massob na-akpọ ndị nnọchite anya wọọdụ Anambara-Saụt n'ụlọomeiwu sineti oku ka ha kwanyere Ojukwu ugwu n'ihi na ikwado nwunye ya ma tụnyere ya bụ inye Ojukwu mkparị."" N'okwu ha, ndị na-akwado Bianca ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị iro Ojukwu na Ndịgbo. Ha kpọkuru gọvanọ ndị na-achị steeti dị n'ọwụwa anyanwụ ka ha kwado Bianca site n'inyere ya na ụmụ ya aka ka ọ ghara ịdị ka Ndịigbo a gbarapụrụ ha. Cheta na nsonso, otu si Massob kewapụta bụ Biafra Independence Movement(BIM) nke Ralp Uwazuruike nọ n'isi ya kwupụtara nkwado otu ahụ nye Bianca ịzọ ọkwa Sineti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44260011,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44260011,Ntuliaka 2019: Ụmụnwaanyị omeiwu kwuru na ha chọrọ oche osote onyeisiala na 2019,"Ụmụnwaanyị omeiwu gara hụụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'Asọ Rọk, Abuja ụbọchị Fraide ịrịọ ya ka o nye ụmụnwaanyị ọkwa osote onyeisiala n'afọ 2019.","Ndị ụlọomeiwu kagburu akwụkwọ iwu gaara inye ụmụnwaanyị ohere pasentị 50 nyekwa ụmụnwoke pasentị 50 Ụmụnwaanyị mere njem ahụ gunyere ụmụnwaanyị niile a họpụtara site na steeti 36 niile dị na Naịjirịa. Onye kwuchitere ha ọnụ ha bụ Elizabeth Ativie kwuru na ụmụnwoke na-ekewapụ ụmụnwaanyị na Naịjiria. Ohere a ne-enye ụmụnwaanyị ugbua bụ naanị pasentị 35 O kwuru na ọ bụ naanị otu mgbe ka ụlọomeiwu nke ukwu na nke nta nwere nwaanyị welitere isi n'ọkwa kemgbe ebidoro ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjiria n'afọ 1999. O gwakwara onyeisiala na ihe ọbụla ọ gwara ha n'ọgbakọ ahụ ""ga-abụ atụmatụ ga-emechaa bụrụ iwu."" Maka nke a, o kwuru na ""oge ọbụla onyeisiala bụ nwoke, osote ya kwesiri ịbụ nwaanyị."" Nwaanyị Ativie kwukwara na n'ime nkewapụta atọ e ji anọchite anya na sineti, otu n'ime onye nnọchite anya kwesiri ịbụ nwaanyị ebe e nwekwara mmadụ itoolu ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta, mmadụ isii kwesiri ịbụ ụmụnwoke ebe mmadụ atọ ga-abụ ụmụnwaanyị. Na nzaghachi, onyeisiala Muhammadu Buhari jiri ọchị gwa ha ""na osote onyeisiala anọghị ebe a mana ebumnuche na onye odeeakwụkwọ ga-agwa ya na a chọrọ ịnara ya ọrụ ya."" Mana o kelere ụmụnwaanyị ahụ maka nkwado ha na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwadoro ya ugbo anọ niile ọ zọrọ ọchịchị. Maka ihe ha rịrọrọ ya, onyeisiala gwara ha na ya ""adịghị ike etu ha chere"" na onye nwereike ime ụdị ihe ahụ bụ onye na-achịụ n'oge ndị amị mana ya edosela akwa amị ya yiri ""agbada"". Onyeisiala Buhari ga-azọ ọchịchị ọzọ dịka n'afọ 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46357104,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46357104,Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015,"Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa kwuru na onye otu ya chịburu Amerịka bụ Barrack Obama, tinyere aka na ntuliaka 2015.","Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015 Jonathan kwuru na ọ bụ aka Amerịka tinyere mere ka ọ ghara ịzọta ọkwa onyeisiala ọzọ na 2015. Oge ntuliaka ahụ ruru nso, Obama mere onyonyo ebe o gwara ndị Naịjirịa okwu, ma zite John Kerry bụ odeakwụkwọ kachasị nke Amerịka mgbe ahụ, ka ọ bịa Naịjiria maka ndọtị adọtịrị ntuliaka ahụ site Febrụwarị ruo Maachị maka okwu nchekwa dị oge ahụ. Jonathan kwuputara nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere dịka Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka na-abịa na Febrụwarị 2019. O kwuru na ebe ekwesịghị ijide ya aka maka ntọ a tọrọ ụmụakwụkwọ 278 n'obodo Chibok, na ọ gaghị ewepụ onwe ya n'ụta maka etu ndị ọrụ nchekwa si daa mba ịgbapụta ha. Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 100 ka nọ n'agbụ ndị Boko Haram. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45065838,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45065838,I so na ndị sị na agbamakwụkwọ Katolik edoghị anya? Lee ihe isii ọ ga-eri gị ịgba akwụkwọ Katọlik na Naijiria,"N'ụka Katọlik na Naijiria, agbamakwụkwọ abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba.","Agbamakwụkwọ abụghị ụkwa achị na'aka n'ụka Katọlik Nchọpụta BBC mere gosiri na ọtụtụ atụmatụ na nkụzi eji akwadọ agbamakwụkwọ n'ụka Katọlik na-eri oge, ego ma sikwa ike. Ọ na-ewe opekata mpe ọnwa isii iji kwado ma gba akwụkwọ n'ụka Katọlik na Naijiria. Na nkọwa ya, otu nnukwu ụkọchukwu ụka Katolik na Lagos Steetị bụ Monsignor Bernard Okodua kwuru na ọ bụ ijikwado ndị a nke ọma. Okodua gwara BBC sị, ""O kwesiri ka ndị mmadụ dị njikere ime ihe kwesiri ka ha mee iji gba akwụkwọ n'ụka dịka iwu Chukwu na nke ụka siri dị."" Otu onye nkụzị alụmdinanwunye n'ụka Katolik dị na Legos, bụ Anselm Uzoma kọwara na nkụzị a nke a na- akuzi na atụmatụ ndị ọzọ so bụ iji kuziere ndị na-akwado ihe niile ha kwesiri ịmata tupu ha agba akwụkwọ. Ọ sịrị: ""Ihe ndị a niile dị mkpa n'ihi na alụmdinanwunye bụ onye gbara ọsọ banye, ya agbara ọsọ pụta."" Ọriakụ Benedatte Etinosa, onye gbara akwụkwọ na St Sabina Catholic Church Idimagoro, Lagos, na ọnwa November afọ 2017 kwenyere na ịgba akwụkwọ Katolik siri ike, ""mana i jisie ike mee ihe ụka sị gị mee, ị ga-ahụ uru dị na ya n'ihi na ị mara na ọ bụghị ihe ị tụtara n'ala."" Atụmatụ ndị ahụ gụnyere: 1. Mkparịtaụka gị na ụkọchụkwụ Ụkwụ mbụ onye ọbụla na-akwado ịgba akwụkwọ na Katọlik na-abụ ị ga-ahụ ụkọchukwu ma kọwapụtara ya ebụmobi gị, ya agba gị na ọnye gị na ya na-akwado agbamakwụkwọ ajụjụ ọnụ ijị mata ma ụnụ adị nkwadebe. Tupu nke a eme, ụkọchụkwụ ga-eji na aka na ị bụ ọnye na-abịa ụka ahụ. Ọriakụ Etinosa kwuru na ""Mgbe m huru Fada, ọ gwara m na mu na di m ga-eso biakọta ọnụ ị gwa ụka ebumnobi anyị."" 2. Ọkwa agbamaakwụkwọ Ana ama ọkwa agbamaakwụkwọ (banns of marriage) ndị na-akwado izu ụka atọ n'ụlọ ụka obodo ya na ebe niile ha biri. Onye nkụzị alụmdinanwunye n'ụka katolik dị na Legos, bụ Anselm Uzoma, kọwara na nke a bụ i ji me ka amata ma onye ahụ onwere onye ọzọ ọ lụrụ. 3. Nnyocha na ikike sị n'aka ụlọ ụka obodo Ha ga-agakwa n'ụlọ ụka dị n'ime obodo ha ị nata ikike na nkwadọ, ebe a ga-enyocha, makwa ọkwa agbamaakwụkwọ ahụ ọzọ. Tupu nke ahụ eme, onye na-akwado ịgba akwụkwọ ga-anata akwwụkwọ n'aka ọtụ ndị ntorobia nke ụka. 5.Ụgwọ dị iche iche Ego Naira ndị Naịjirịa Ndị na-agba akwụkwọ na-atụ ọtụtụ ụtụ dị iche iche. Oriakụ Etinosa kọwara: ""Oge m wegara ọkwa, ha gwara m na m ga-akwụ ego youth na chọchị development. Ha nara m N6000 maka ịmepe ụlọ ụka ime obodo. Ndị youth nara m N3,000. Mana, na Legos, onweghị ihe ọbụla ha nara anyị."" 6. Nkuzi agbamaakwụkwọ A macha ọkwa, ma o nweghị onye megidere ya, onye ọbụla na-akwado ịgba akwụkwọ na-aga nkụzi ọnwa isi nke bụ iwu tupu agba ya akwụkwọ. Oriakụ Etinosa sị, ""Di m abụghị onye Katọlik, mana dịka iwu Katolik siri dị, o sonyere na nkuzi ahụ. Soso ihe dị iche bụ na ụbọchị agbamakwụkwọ, ọ gaghị a nata oriri nsọ."" Ọ bụ ka nke a mechara ka ndị chọrọ ịgba akwụkwọ na ụkọchụkwụ na-atulekwa ma nwe mkpebi ụbọchị ha ga-eme emume agbamakwụkwọ ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: 'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii'" afirika-55792500,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55792500,Ebonyi State Ezza Effium Crisis: Mmadụ 25 anwụọla n'ọgbaghara dapụtara ebe ahụ,Mmadụ iri abụọ na ise anwụọla ebe ụlọ otu narị na iri abụọ na ise gbara ọkụ n'ọgbaghara dapụtara n'Ezza na Effium dị n'Ebonyi steeti.,"Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi kwuru nke a ma kwuo na anapụtala ndị omekome egbe ruru iri abụọ na isii. Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti Ọ majara ndị isi mpaghara ahụ na ọ ga-anwụchi ha ma kwụsị ọrụ n'okporoụzọ ọ na-arụ n'ebe ahụ maọbụrụ na ndị ahụ ekpezighi udo n'etiti ha. Umahi bara mba a na nzụkọ ikpezi udo nke ehiwere n'etiti obodo abụọ ndị a nke ndị ọrụ nchekwa na ndị nọchiri anya ụlọụka so na ya. ""O nweghi mmepe obodo ga-abịa na mpaghara ahụ maọbụrụ na amaghị ihe emere esemokwu a"" ka o kwuru. Ndị uweojii ejichiela ihe ruru mmadụ iri atọ aka ha dị n'ọgbaaghara dapụtara n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Sọnde nke tara isi ụfọdụ mmadụ. Ihe ruru mmadụ anọ nwụrụ n'ọgbaaghara ahụ nke dapụtara n'etiti ndị ọrụ ụgbọala a kpọrọ 'National Union of Road Transport Workers'. Ebe ya bụ ihe mere bụ n'obodo Effium nke dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu. Francis Nwaeze, onye enyemaka mgbasaozi nke Gọvanọ Dave Umahi, gwara BBC Igbo na gọvanọ na ndị ọrụ ya ga-aga n'obodo Effium n'elekere mbụ nke ụbọchị Mọnde a. Etu e si wakpo ma gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ọ bụ oge a na-eme ntuliaka ndị ga-achị ya bụ otu ka ọgbaaghara nọ dapụta. Mana akụkọ na-ekwu na ndị nwụrụ n'ọgbaaghara ahụ ruru asatọ. Dịka ụlọntaakụkọ 'The Sun' si depụta, ndị e jichiri n'ihi ya bụ ọgbaaghara gụnyere Clement Odah, bụ onyeisi okpuru ọchịchị Ohaukwu, Chinedu Awo, bụ onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara Ohaukwu, Sunday Agbo bụ nchịkọta 'Effium Development Centre', nakwa Eucharia Ogwale onye nchịkọta 'Effium South Development Centre'. Ndị ọzọ bụ Emmanuel Uzor na Emmanuel Igwe bụ ndị enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ Dave Umahi. Nwoke a na-ebe akwa maka nwunye abụọ ya nwụrụ n'ihe mberede Ebonyi Akụkọ igbu mmadụ apụtala ugboro ugboro n'Ebonyi steeti n'ọdị nso a dịka ndị otu nzuzo dị icheiche na-aluso onwe ha ọgụ. Mana ọgbaaghara nke ụbọchị Sọnde bụ nke mbụ na-esi n'aka ndị ọrụ ụgbọala. Ọtụtụ ụlọ nakwa ụgbọala ndị mmadụ ka a lakwara n'iyi na ya bụ ọgbaaghara. Gọọmentị etinyela mmachi mkpagharị na mpaghara ebe ọgbaaghara a dapụtara. Gọvanọ Dave Umahi machikwara ndị NURTW ịrụ ọrụ na steeti ahụ ọzọ ruo mgbe ihe niile dajụrụ." afirika-51132547,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132547,A dọpụtala nwoke ụlọ dagidere na Legọs.,A zọpụtala otu nwoke tọrọ n'ime ụlọelu dara na mpaghara Ago Palace dị na Legọs.,"Akụkọ ndị dị mkpa: Ọnụ na abụ otitọ bụ ihe jupụtara n'ọnụ ọtụtụ nọ ka a zọpụtara nwoke a nọọrọla n'ọgburu ụlọ dara ada ọtụtụ awa. Olufemi Damilola Oke-Osayintolu bụ onyeisi ụlọọrụ gbatagbata na Legọs sị: ""Ụlọelu dara bụ ụlọ aka na-arụ arụ. Ọdịda ya metụtara otu ụlọ dị ya nso."" Otu onye nọ ebe ihe mere sị na ọ bụ nwanne ya ka ụlọ a dagidere ma rịọbuo ka gọọmenti nyee aka zọpụta ya ka ha mara ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. Ụlọikpe ukwu agbawaala Ifeanyịi Uba aka Ifeanyi Uba Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla ikpụpụ n'akụkụ mkpebi nke ụlọikpe ọzọ kpebiburu nke napụrụ Senetọ Ifeanyi Uba nke otu YPP ọkwa ịnọchite mpaghara 'Anambra South' n'Ụlọomeiwu Ukwu. Na nkọwa ya, Ifeanyị Uba kwuru na ụlọikpe achụtunghị ya kama o nyere ndị ikpe ahụ metụtara ntuziaka ka ha gawa n'ụlikpe mkpegharị maka ikpe ahụ. Cheta na ụlọikpe ọzọ napụrụ Uba oche ya n'ihi ebubo iji asambodo NECO adigboroja zọọ ọkwa Senetọ na ntuliaka 2019 ma nyee Inec iwu ka ha were oche ahụ nyefe Obinna Uzoh. Buhari apụọla gaa London Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjirịa gawa London ebe ọ ga-esonye na ọgbakọ UK-Africa Investment Summit nke ga-amalite n'abalị iri abụọ nke ọnwa Janụwarị a. Gọvanọ Abịa Steeti bụ Okezie Ikpeazụ nakwa nke Gombe bụ Inuwa Yahaya so Buhari wee mee nje m a. Umunne atọ na Scotland emeela ihe ịtụnanya Umunne atọ ndị mba Skọtland edebala aha ha n'akwụkwọ akụkọ dị ka ndị mbụ ji ụgbọ epeepe wee gaa oshimiri Atlantic gburugburu n'oge kacha nta. Umunne atọ a aha ha bụ Jamie, Ewan na Lachlan Maclean, bụkwa umunne atọ izizi kparala ụdị ike a n'ụwa. Awaziem na Omeruo Awaziem na Omeruo na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Leganes nke dị na mba Spen Ụmụ Naịjirịa abụọ bụ Kenneth Omeruo na Chigozie Awaziem na-achazị ka ọkụ n'otu egwuregwu ha bụ Leganes nke mba Spen. Omeruo na Awaziem bụ agada gbachiri ụzọ nke mere na emeribeghị Leganes n'asọmpi isii ikpeazụ ha. 'Inflation' mere na Disemba karịrị nke afọ abụọ gara aga' Ọnụ ego ahịa rịrị n'ọnwa Disemba bụ ọnwa nke anọ o bidoro ịrị, mere ka ọ bụrụ mgbe kachasị n'ime afọ abụọ ihe a na-eme dịka ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ na Naịjiria si kwuo. Site na pasentị 11.85 ọ nọbu n'ọnwa Nọvemba, ọ rigoruru na pasentị 11.98. 'A ga na-abịa agba ụzọ ọjọọ anyị nkiri' Minista mba Uganda na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi, ekwuola na okporoụzọ ndị kacha njọ dị na mba ha nwereike ịbụ ihe ndị si ofesi ga na-abịa agba nkiri. Henry Okello Oryem mechara kwuo na ọ bụ egwuregwu ka ọ na-egwu, kwuru na ndị si mba ndị ihe na-aga nke ọma nwereike ịhụta ịkwapụta ụgbọala na ndagwurugwu dịka ihe a ga-agba nkiri. Onye ka Manchester United ga-azụ na Jenụwarị a? Edinson Cavani Ọ bụghị Edison Cavani! Kepu kepu si n'ọgbọegwuregwu apụta na-akọwa na Manchester United nwereike igote Edison Cavani na-agbara ndị PSG n'afọ a, kama na ọ gaghị abụ n'ọnwa a. Mmebi 'National Grid' etinyela ndị Naịjirịa n'ọchịchịrị ọzọ Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghi ọkụ afọ ruo afọ Ọtụtụ ebe na Naịjirịa rahụrụ n'isi dịka ọkọtọ banyerwe igwe ọku akpọrọ National Grid na Bekee. Ndị mmadụ n'ugwu, ọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ ahụghị ọkụ ma ncha kemgbe elekere abụo nke ehihe ụnyaahụ kama o nwere ndị na-ekwu na ha enwetela ọkụ n'ụtụtụ a. Ndị na-ere ọku latrịk na-ekwu na ha no n'ụzọ iweghachite ọku latrịk dika emesiri ihe mebiri. Mba ndị na-asụ Bekee si na ha esoghi n'ego Eco Ego CFA N'akụkọ ọzọ, Mba ndị mpaghara Ọdịda-Anyanwụ Afrịka na-asụ bekee, nakwa mba Gini, ajụla isonye n'atụmatụ ego ọhụru mba ndị na-asụ French wepụtere akpọrọ Eco. Ha kwuru na mba dị a kpebiri atụmatụ ego ECO a, na-ajụghị mba ndị ọzọ nọ n'okpuru Ecowas ihe bụ uche obi ha. Egbuola ndị agbụru Fulani iri na ise na Mali Ndị agha Mali Akụko si mba Mali pụta na-akọwa na ndị oji egbe wakporo otu obodo ndị Fulani ma gbuo mmadụ iri na ise. Ndị ọrụ nchekwa sị na ha na-eche na ọ bụ ndị nta si agbụrụ Dozo kpara mkpa mkpa a. N'egwuregwu, Reece James ebidorola Chelsea bọọlụ ugboro isii kemgbe a zụtara ya Reece James bụ onye egwu azụ na Chelsea ebinyela aka n'akwụkwọ ga-eme ka ọ nọrọ n'otu ahụ ruo afọ 2025. James dị afọ iri abụọ ugbua, kwuru na ndọtị oge ya bụ mmezu ọchịchọ obi ya. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45397445,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45397445,Ihe Igbo sọrọ nwaanyị ime,"N'omenaala Igbo, nwoke na nwaanyị ahaghị aha n'anya.","A na-agbado ụkwụ ma mmadụ abụ nwoke maọbụ nwaanyị n'ike ọrụ maọbụ oke dịrị onye. Ụmụnwoke n'agbanyeghị ma ha abụ nwata, karịrị nwaanyị n'ọkwa na ngụkọ dịka omenaala Igbo si dịrị. Ya mere, o nwere ọrụ maọbụ ohere a mabidoro na nwaanyị enweghị ikike ya nke bụ na nwaanyị nupuru isi n'ihe ndị a 'mere arụ'. Lee ụfọdụ n'ime ihe ndị nwaanyị anaghị eme: 1. Nwaanyị anaghị arị maọbụ ete nkwụ Nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ala Igbo N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu nkwụ, elu ọjị maọbụ ọjịị. Ngawuchu kwuru na nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ihi na nwaanyị esighị ike. ""O nwere ike rịa elu nkwụ, hụ agwọ, egwu ejide ya, ọ daa n'elu."" N'okwu ọkammụta asụsụ Igbo na Mahadum Legọs (University of Lagos) bụ Chigozie Nnabuihe, ọ bụ iji chekwa ugwu nwaanyị. Nnabuihe kọwara na oge gboo, nwaanyị anaghị eyi akwa na-awachi ahụ nwaanyị nke mere na ọ rịa elu, onye nọ n'ala ga-ahụ ọtọ ya. 2. Nwaanyị anaghị eketa ala obi Nwaanyị nwere ike inweta ebe ịkọ ubi mana ọ gaghị enwe ikike ire ya maọbụ nye onye ọzọ N'ala Igbo, nwaanyị anaghị eketa ala obi. Nkwenye Ndigbo dịka otu okenye, Chukwudi Nganwuchu, siri kọwa bụ na nwaanyị nwere oke naanị na be di ya. Mana n'ezie, nwaanyị anaghị enweta oke na be di ya ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwoke. O nwere ike e nye nwaanyị ebe ịkọ ọrụụgbo mana ọ bụghị nke ya n'ezie n'ihi na onweghị ikike ire ya maọbụ inye ya onye ọzọ. 3. Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke, ọ naghị aga agha Nwoke ka ọ dịrị iga agha n'ala Igbo Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke n'ọgbakọ maọbụ n'agha. Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuhe sị ""O bụ nwoke ka ọ dịrị ichekwa ezinaụlọ ya. Ọ bụ ụmụnwoke ka ọ dịrị ichekwa obodo."" 4. Nwaanyị anaghị awa ọjị Nwaanyị anaghị awa ọjị ebe nwoke nọ. Ọ bụ naanị oge ụmụnwaanyị gbakọrọ naanị ha ka onye kachasị okenye n'ime ha nwere ike ịwa ọjị mana ọgaghị agọ ya agọ. Dịka Nnabuihe kwuru, ihe kpatara na nwaanyị anaghị agọ ọjị bụ na ọjị bụ ihe dị nsọ, nwaanyị nwere oge ọ na-anọ na nso; ọ ga-emerụ ọjị. 5. Nwaanyị anaghị ekenye nwa di Nwanyị anaghị anọ ebe a na-ekwu akụ nwaanyị ọ masị ya, ya bụrụ na di ya anwụọla. Nnabụihe sị ""Ọ bụ iji gosi na ọbụghị anụmanụ ka a na-azụ, ọ bụ mmadụ ka a na-alụrụ. Ọ bụ anụmanụ na-anọ ebe a na-ekwe ya ọnụ."" 6. Nwaanyị anaghị ata eke ọkụkụ Nwaanyị ekwesighị iri eke ọkụkọ dịka omenaala Igbo siri dị Otu okenye aha ya bụ Chukwudi Nganwuchu gwara BBC Igbo na ihe mere ndị gboo jiri machie nwaanyị ịta eke ọkụkọ bụ na e nwere nkwenye na eke ọkụkọ na-atọ ụtọ ebe ọ dị ukwu nke na 'nwaanyị tara ya ga-ebido gbawa n'ezi.' Nnabuihe kwuru sị, ""Eke ọkụkọ bụ nke nwoke. Akpụrụotule bụ nke ya, isi ya nke diọkpara. Ada nwe ukwu ya. agba dịkwara ada."" 7. Nwaanyị nọ na nsọ anaghị esiri onye chiri echichi n'ala Igbo, nri. Ọ bụrụgodu na di ya bụ onye chiri ọzọ, ọ gaghị eri nri nwaanyị ma ọ nọrọ na nsọ. Nnabụihe sị, ""Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ. Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya."" 8. Nwaanyị anaghị alụ nwoke Nwaanyị enweghị ike lụọ nwoke etu nwoke si aga alụ nwaanyị. 9. N'ekele, nwaanyị anaghị eri aka atọ N'ekele, nwaanyị anaghị ana aka Nwaanyị anaghị eri aka atọ maọbụ kwuo 'Igbo kwenu', 'Ndigbo mmammanụ o'. ""Nwaanyị nwere ike ikwu, ""Ndị di m ekele m ụnụ o!'"" ""Ọ bụghị nwoke niile na-ana aka atọ. Ọ bụ nwaanyị chie elu chie ala, onweghị ike ana aka atọ, abụọ maọbụ otu."" 10. Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwụ Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwu Agaghị agụchali ihe nwaanyị agaghị emenwu n'ala Igbo mana ọ dị mkpa ma ị mara na ihe ị na-eleda anya na ọbụghị ihe bụ nso: Nwaanyị ekwesịghị ịnụ ike nkwụ n'omenala Igbo. Nnabuihe sị, ""Ọ bụ ihe na-enye nwoke ike ọ ga-eji rụọ ọrụ dịrị ya."" Na nkọwa ya, o kwuru na ọbụghị mmegbu kpatara ndị gboo ji nwee iwu ndị a niile kama na onye ọbụla ma nwoke, nwaanyị na ụmụaka nwere ọrụ ya n'ala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44763692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44763692,Asambodo NYSC ọ dị mkpa n'inwe ọkwa ọha na Naịjirịa?,Onye ọbụla a họpụtara maka ọkwaọha na Naịjirịa kwesiri inwe ụfọdụ ihe tupu ha abanye ọkwa ahụ n'ezie.,"Ọ bụrụ na ọ bụ ọkwa minista, iwu Naịjirịa kwuru na onye ahụ ga-enwe opekatampe, asambodo ụlọakwụkwọ sekọndrị dịka onye nọ n'ọkwa ụlọomeiwu. Agbanyeghị iwu gbasara asambodo, o nwere iwu ndị ọzọ mmadụ ga-agafe tupu ha malite ị bụ minista n'obodo Naịjirịa. Ka o si aga Adeosun ebe ọ na-edenye aha dịka onye anabatara ka minista ala Naịjirịa Mgbe aha mmadụ pụtara dịka minista ala Naịjirịa, onyeisiala họpụtara ya ga-ebuzo zie ozi ka e mee nyocha nke gbasara nchekwa. Ndị ga-eme nyocha a bụ ndị uweojii pụrụịche na-ahụ maka nchekwa ndị nọ ọchịchị a kpọrọ SSS n'aha ịchafụ. Ha ga-ekwu n'ozuru oke tupu onye ahụ aga n'ụlọomeiwu E rue n'ụlọomeiwu, ụlọ nke ukwu bụ Sineti ga-emekwa nyocha nke ha ma jụ kwa onye ahụ ajụjụ ọfụma tupu a nabataya dịka minista ala Naịjirịa. NYSC ọ dị mkpa? NYSC bụ usoro ofufe ala Naịjirịa ehibere kamgbe afọ 1973 iji chịkọta odinotu ala Naịjirịa. E hibekwara iwu ga-ekpuchi omume ha n'afọ 1993 n'okpuru ọchịchị Ibrahim Babangida. Ọ bụ ndị gụchara mahadum maọbụ nwete ihe yiri asambodo mahadum n'ọgụgụakwụkwọ bụ ndị kwesiri ị mee emume a na-eru otu afọ. Onye okaiwu bụ Kayode Ajulo gwara BBC Igbo na ọ dịghị mkpa ị nwe asambodo NYSC tupu anabata gị dịka Minista ma na onye iwu kwuru na onye ọbụla gụchara mahadum ga-eferiri ala nna site na NYSC. Ihe iwu NYSC kwuru Iwu hibere NYSC nke emegharịrị n'afọ 1993 kwuru na onye ọbụla achọghị ị fee ala nna ga: Ihe butere okwu bụ na ụlọọrụ ntaakụkọ ebola minista na-ahụ maka akụnaụba ebubo mmerụka asambodo NYSC. Dịka iwu NYSC kwuru, onye ọ bụla achọpụtara dara iwu a ga-aga ụlọmkpọrọ maọbụ kwuọ puku naira abụọ. Ajulo kwukwara na ọ dịghị mma ị nye mmadụ ọkwa ọha ọbụla ebe a maara na o nweghi asambodo ziri ezi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53468805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53468805,Izu Madubueze: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okorọbịa a,Akụkọ na-ewu ọkụ ugbua bụ akụkọ pụtara gbasara otu okorọbịa echere na o gburu onwe ya maka ebubo ụgha.,"Dịka ọ dị ugbua, akụkọ si na nke mbụ pụta bụ na ọ bụ n'ihi ebubo mwakpo ụgha ka o ji were ndụ ya. Ndị enyi ya bu iwe n'obi were depụta akụkọ a na-ekwu na oge eruola a ga-achọ ihe e mere onye ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha. Ha malitere #JusticeforIzu iji kwupụta na ekwesiri inye Izuchukwu ikpe ziri ezi ma n'ọnwụ. Ugwunna Ejikem kwuru na a ga na-eme ndị boro ndị mmadụ ebubo mwakpo ụgha, otu ihe a na-eme ndị mere mmadụ mwakpo Zaddy Clinton na-ekwu na nwaanyị ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha kwesịrị ị ga ụlọ mkpọrọ Isheunife na-ekwu na ọ bụ naanị n'ihi na ọ jụrụ nwaanyị ahụ ọyị ka o ji boo ya ebubo a were ndụ ya Otu onye ma Izuchukwu achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC n'ozi ekwentị na nke a mere n'ezie nakwa na o na-ewute ha nke ukwu. O kwukwara na ọ bụ na mba Amerịka ebe nwa okorọbịa ahụ bi ka akụkọ a mere. Iwu mba Amerịka nyere ohere ka onye ọbụla eboro ebubo ụgha kpụpụ onye boro ya ebubo ahụ ụlọikpe." afirika-52286924,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52286924,Coronavirus Myths: I nwereike ibute coronavirus site na ahụrụ?,"Dịka ọria coronavirus na-akpa ike na-aga n'ihu na Naijiria na mbaụwa, kepukepu ọhụrụ na-efegharị ugbua bụ na e nwere ike ibute ọria ọjọọ a site n'ahụrụ.","Mana ndị ọkachamara ahụike gwara BBC lgbo na mkpụrụ adịghị n'ụkwa a ndị na-efesa ya bụ akụkọ na-apị. Kemgbe ọrịa coronavirus pụtara mbụ na Chaịna n'afọ 2019 ruo ugbua, ọria a nke ndị ọkachamara kwuru na a na-ebute site n'ụkwara maọbụ uzere, ataala isi otu ijeri mmadụ na ụma n'ụwa nile. Aka nile dị n'ọbọ ime nchọpụta maka ya bụ ọrịa, ọkachasị ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ nakwa etu ọrịa si ekesa. Otu ndọrịtaụka ọhụrụ pụtara n'ịntanetị bụ nkwenye ụfọdụ na mmadụ nwere ike ikuru coronavirus n'ahụrụ onye bu ọrịa a nyụrụ ọkachasị onye eyighị ọbante. Ọkachamara n'ihe gbasara nje nke Bekee kpọrọ 'virologist' bụ Ọkammụta Oyemade Tomori sị na, ""onye na-ekwu ụdị okwu a na-ama njakịrị."" O kwuru na ""e nwere ike ịhụ nje a na ngụgụ nakwa akụkụ ndị ọzọ e ji eku ume."" Ụfọdụ ndị ọkacha mara kwuru na e nwer ike ịhụ nje coronavirus na nsị onye bu ya bụ ọrịa Dọkịta ahụike ọha na 'Lagos University Teaching Hospital' (LUTH), Dkta Bayo Onajole nakwa odeakwụkwọ otu jikọrọ ndị sayentist (Nigeria Academy of Science) bụ Dkta Doyin Odubanjo tinyekwara ọnụ n'ihe Tomori kwuru. Onajole sị na, ""ọ bụghị eziokwu"", ebe Odubanjo si na""anụbeghị m ya mbụ"". Mana Odubanjo na Tomori kwuru na nchọpụta gosiri na nje coronavirus nwere ike ịdị na nsị onye bu ya. Tomori, onye bubu onyeisi NASS sị, ""N'ezie, e nwere ike ịhụ ya na nsị."" N'otu aka ahụ, Dkta Odubanjo si, ""nchọpụta na-ekwu na-enwere ike ibute ya na nsị onye bu nje ahụ ọbụladị ma nnyocha kwuo na ọ gbakela"". ""Ya mere o ji dị mkpa ịkwọ aka ọfụma ma ị gachaa ụlọmposi."" Mana Onajole ekwetaghị na e nwere ike ibute nje coronavirus na nsi. O kwuru na coronavirus bụ ""ọrịa ọwa e si eku ume, (gastro-intestinal tract), ọ bụghị ọrịa nsi nke bụ nsi na nsị na ọnụ (fecal-oral)""." egwuregwu-53015391,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53015391,June 12 : Ihe asaa ọchịchị onyekwuoucheya gbanwere na Naijiria n'afọ 21,Taa bụ abalị iri na abụọ nke Juun afọ 2020 bụ ncheta emume ọchịchị onyekwuoucheya (Democracy Day).,"Tupu abali isii nke ọnwa Juun afọ 2018 bụ oge e megharịrị ya, a na-emebu emume a n'abalị 29 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị ndịagha were ọchịchị nyefe n'aka ndị nkịta n'afọ 1999. Mana Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari higharịrị ya rue abali 12 nke ọnwa Juun, iji kwanyere Moshood Abiola, bụ onye nwụrụ n'ọgụ inwenta ọkwa sitere na mmeri o nwere na ntuliaka onyeisiala e mere n'a Juun 12, afọ 1993. na mmeri o meriri na ntuliakagha O meela afọ iri abụọ na otu ọchịchị Naijiria banyere n'aka ndị nkịtị na-enweghị mgbubi ọbụla; afọ asatọ nke Olusegun Obasanjo, afọ abụọ nke Musa yar'Adua, afọ isii nke Goodluck Jonathan na afọ ise nke Buhari. Ajụjụ ụfọdụ ụmụ Naijiria kpụ n'ọnụ bụ ole ihe ọchịchị isi n'aka ndị uwe kakị banye na aka ndị uwe agbada wetara na Naijiria ka ọchịchị onyekwuoucheya bụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị? Lee ihe ise gbara ọkpụrụ o wetara dịka ndị okwu ọchịchị na mwulite obodo dọrọ anya sị kọwaa: 1. Ohere ikwu uche gị Democracy day: 'Buhari jide aka a o ji rụọ na ngwụcha, ọchịchị ya ga-abụ ihe lara n'iyi' Mgbanwe dị ọkpụrụkpụ bụ na ndị mmadụ na-eso ekwu onye ga-achị ha site na ntuliaka, ọ bụghịzị onye ndịagha tụrụ aka ha enye ya ọkwa ọchịchị. Larry Ọgụego bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye sị, ""Otu ihe anyị ritere bụ na ndị mmadụ nkịtị nwere ike pụta soro na-ekwu ihe na-eme n'obodo."" 2. Ịkwanye ugwu nye ikike dịrị onye Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa Kemgbe a banyere n'ọchịchị onyekwuoucheya, a na-agbaso Iwu Naijiria were na-eme ihe. Onye ihe e mere ya adịghị mma, ọ gaa n'ụlọikpe ịnata ikpemkwụmọtọ mana ọ dịghị otu a n'oge ọchịchị ndịagha. ""O nyela anyị ikike gbasara oke ruru anyị. Ọnụ na-eruzi anyị n'okwu."" 3. Alaka atọ ọchịchị na-arụ ọrụ Ndị omeiwu(legislature) na-arụ ọrụ, ndị ụlọikpe(judiciary) na-arụ ọrụ ha, ndị ọchịchị(executive) na-arụkwa nke ha. Ihe nke pụtara bụ na o nweghị alaka ọchịchị na-ebi okwu n'ihe ọbụla. Ikike diri onye,mmepe obodo na ihe ndị ọzọ mere ọchịchị ndị nkịtị ji ka nke ndị isiabaokpu mma' Tupu ugbua, naanị ndịagha na-ekwu ihe a na-eme. Ha na-ekpe, na-ebi. Oguego kwuru na ""ndị mmadụ na-eme iwu na-arụ ọrụ ihe gbasara mmadụ."" 4. Mwulite akụnaụba obodo Ọkacharamara n'ihe gbasara mwulite akụnaụba bụ Boniface Chizea sị na ọchịchị onyekwuuche ya wetara mwulike akụnaụba na Naijiria ọkachasị n'afọ asatọ mbụ nke olusegun Obasanjo. Iji maa atụ, dịka ụọakụ mbaụwa bụ IMF si kwuo, akụ Naijiria na-emepụta nke a kpọrọ 'GDP n'aha ịchafụ gbaliri site na $55.65 ọ bụ n'afọ 2003 rue ijeri dọla $114.36 n'afọ 2006. Chizea sị na ego Naijiria ji echekwa onwe ya na mba ọzọ gbalitere rue nde dọla 40. Mana ọ tụrụ arịrị na ya bụ ego agbadala ugbua rue ihe dịka ijeri dọla 30 n'oge ọchịchị Buhari. Ọ bụ n'oge a ka e rere ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti (privatisation)resị ndị nkịtị nke wetara nnukwu ọganiru n'akụnaụba. E rere ụlọọrụ Nitel ma nye ndị nọrọ onwe ha ikike ibido ọrụ ekwentị nke mere e ji nweta ụlọọrụ MTN,GLO, Airtel na Etisalat. Atụmatụ nke mere ka ekwenti kwusi ịbụ njirimara ọgaranya mabụrụ ihe rutere ma nnukwu mmadụ ma ogbenye aka. 5. Mmepe obodo Ọrụ Akwa Naịja nke abụọ ka nọ n'isi mbido Mgbanwe ọzọ dị mkpa nke ọchịchị onyekwuouche ya wetara na Naijiria bụ mmepe obodo; okporoụzọ, ụlọọgwụ na ụlọakwụkwọ. A gbapere ọtụtụ ụlọakwụkwọ site na praimarị, sekọndarị rue mahadum. Mahadum sitere na 118 n' afọ 1990 rue 170 ugbua ( nke gụnyere mahadum gọọmenti etiti, nke steeti nakwa nke ndị nọrọ onwe ha) dịka gọọmenti nyere ikike na ndị nọrọ onwe ha mepe mahadum. 6. Mwepụ mmachi obodo ndị mepere eme machiri Naijiria Ọtụtụ mba dịka US,UK na mba ndị ọzọ di n'Yorop gbakọtara Naijiria azụ n'ihi ọchịchị aka ike n'oge ọchịchị ndị agha mana nke a gbanwere ngwangwa ọchịchị bara n'aka ndị nkịtị. Ọmụmaatụ: N'afọ 1995, oge ọchịchị Sani Abacha, gọọmenti gburu Ken Saro-Wiwa na mmadụ asatọ ndị ọzọ (Ogoni 9) maka ogbugbu e gburu ndị ichie MOSOP asatọ bụ ndịna-akwado gọọmenti, otu 'Commonwealth' mapụrụ Naijiria afọ abụọ. A machikwara ndị nọ ọchịchị na ndị ezinaụlọ ha ibanye ụfọdụ mba ofesi. Mana e wepụrụ mmachi ndịa niile ka ọchịchị laghachiri n'aka ndị nkịtị. 7. Ndị ma ihe a na-akọ nọ n'ọkwa kwesịrị ha E tinyere ndị ma nke a na-akọ n'ọkwa kwesịrị ha, ọkachasị n'oge ọchịchị Obasanjo. Nke a nwetara ezigbo mmepe na mwulite akụnaụba dịka ha si n'amamihe na nka ọrụ ka kwalite akụnaụba Naijiria. Ndị dịka Ngozi Okonjo-Iweala, Charles Soludo, Oby Ezekwesili, Nasir El Rufai, Akinwunmi Adesina, Dora Akunyili bụ ọchịchị onyekwoucheya tụpụtara ha. Mana ọ dịghịchakwaghị otu a ugbua. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44255158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44255158,Mkpocha ala Ogoni: Ka o si kwụrụ,Na ngwupụta mmanụ agbidi na Naija-Delta emebiala mmiri na ala ma mee ka ọrụgbo na ndụ dị na mmiri nwe nsogbu abụghị akụkọ ọhụrụ.,"Okwu a bụ okwu dịgoro afọ kwuru afọ kemgbe Ken Saro Wiwa, nwa afọ Naija-Delta nwụrụ anwụ jiri bido ọgụ ka a kwụsị ihe na-emebi na mpaghara ahụ, okwu nke ọ tunyere ndụ ya. Okwu akpụ n'ọnụ bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu gbasara mgbocha ala Ogoni na-akpụ ka eke kemgbe e jiri kwube ya. Cheta na ọchịchị onyeisiala Mụhammadụ Buhari kwere nkwa na a ga-ebido mkpocha ahụ n'afọ 2016. Mana onwebeghị ihe a hụrụ anya a na-eme. N'izuụka gara aga, iji gosi na nkwa ahụ abụghị okwu e ji emeju okwu, Buhari nyere NNPC iwu ka ha wepụta ego maka ibido mkpocha Ogoni. Mana n'uche ọtụtụ ndị mmadụ, ọ bụ mgbe a hụrụ ndịọrụ na ngwaọrụ ebe a na-atụ anya ha ka ha ga-ama n'ugo berela na mgbagbu. Ndị ala Naija-Delta na-ebe akwa na mmanụ agbidi emebiela ala ha Na mkparịtaụka ya na onye ntaaakụkọ BBC nwere, otu onye na-alụ ọgụ maka nchekwa gburugburu bụ Celestine Akpobari, kwuru na agbanyeghị na okwu mkpocha Ogoni na-akpụ akpụ, o birila ọkụ. ""Anyị na-akpụ akpụ n'ezie, mana ọ bụ ihe dị mma na o bidola."" Akpobari kwuru na ihe mere mbido ọrụ jiri wee oge bụ na kemgbe ewepụtara ozi maka nsogbu ahụ n'afọ 2011, mmebi gburugburu ọhụrụ dịka nkwafu mmanụ emela, nke mere o ji dị mkpa na a ga-enyochakwa ọnọdụ nsogbu ahụ ọzọ tupu e bido ọrụ. Na nso nso, Marvin Dekil, bụ onyeisi otu na-ahụ maka inyocha mmerụ e merụrụ mpaghara ahụ nke a kpọrọ, 'Hydrocarbon Pollution and Remediation Project (HYPREP),' na bekee o kwukwara na ihe ọzọ bụ ọkpụkpụ mbido ọrụ ahụ bụ igbaso usoro inye ọrụngo maka mkpocha ahụ dịka iwu (Procurement Act) siri kwuo. Ka ọ dị ugbua, e meela mgbasaozi maka ụlọọrụ ndị ga-ewughari mmiri na gaasị n'obodo ndị ihe mebiri na ya. Mana ole ebe ọrụ e kwuru ga-ewe afọ iri atọ na ise ikpocha ga-ejedebe? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45807479,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45807479,Mmechi ahịa Ghana: Nwaanyị Igbo akwụọla ụdọ,"Otu jikọrọ ndị Naijiria na-azụ ahịa na Gana a kpọrọ National Association of Nigerian Traders (NANTs), Ghana na bekee kwuru na Oriakụ Stella Ogonna Okpaleke, kwụrụ ụdọ ka emechịchara ọdọahịa ya na di na mba ahụ.","Ịkwụ ụdọ na-arịzị elu n'ihi ihe isiike na nsogbu ndị ọzọ Onyeisi otu ahụ bụ Chukwuemeka Nnaji kwupụtara nke a oge otu ahụ gara ịhụ onye ojeozi onyeisiala Buhari n'okwu gbasara ndị ala Naijiria bi mba ọzọ bụ Abike Dabiri-Erewa. Nnaji kọwara na nwaanyị ahụ ji ụmụ atọ gbara mbibi n'ụlọaku ebe ndị ọchịchị Gana mechiri ọdọahịa ndị o nwere. ""Na ụbọchị Satọde, 22 nke ọnwa Septemba otu onye otu anyị bụ Stella Ọgonna Ọkpaleke, onye ndị ọchịchị Gana kpọchịrị ọdọahịa ya egbuola onwe ya."" ""O kwụrụ ụdọ dịka a kpochiri ọdọahịa ya na nke di ya, ebe o nwezighị olileanya na a ga-agbape ya. ""Nwaanyị ahụ bụ onye okpuru ọchịchị Nnewi n'Anambra steeti. ""Ọ gbara mbibi n'ụlọakụ mana anyị amaghị ego ole o ji ha."" Nnaji onye tụrụ arịrị na mkpagbu a na-eme ndị Naijiria bi Gana nakwa ndị na-azụ ahịa na arịọ gọọmenti Muhammadu Buhari ka ha gbatara ha ọsọ ha. Cheta na mba Gana wepụtara iwu na onye ọbụla na-azụ ahịa ga-akwụ otu nde dọlla n'aka mịnịstri mba ahụ na-ahụ maka azụmahịa ma mechikwa ọdọahịa ọtụtụ ndị na-azụ ahịa, nke metụtara ọtụtụ ụmụ Igbo bi na mba ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43437269,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43437269,'Agwa ndị mmadụ na-akpasa m maka alụghị di na-ewute m',Nkiru (anyị etinyeghị aha nna ya dịka anyị siri kwe ya nkwa) dị ihe karịrị afọ iri atọ na-arụ ọrụ dịka onye na-anabata mmadụ n'ụlọọrụ ha dị na Lagos mana ọ lubeghị di.,"A na-emekpa ụmụagbọghọ na-alụbeghị di ahụ Nkiru gwara onye ntaakụkọ BBC na ọnọdụ ya na-ebutere ya mkparị, mmegbu, ịkpa oke na ihe obi ọjọọ n'aka ndị ezinaụlọ ya na ndịọzọ. ""Oge ikpeazụ m gara ụlọ, ndị ụlọ anyị gwara m na m alọtazina ụlọ ma o buru na onweghị nwoke m ji aka lọta."" Ọ tụrụkwara arịrị na nwanne nna ya (nna ya anwụọla) anaghị enye ya na nwanne ya nwaanyị oke ruru ha n'ihi na ha alubeghị di. Gee ihe Nkiru kwuru: Ndị ụlọ anyị sị m alọtazila ụlọ ma ọ bụrụ na onweghị nwoke m ji aka' 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' N'ala Igbo, ịlụ di bụ ihe e ji agụ onye tozuru okenye Dịka nchọpụta nke ọnụọgụgụ na ahụike nke a kpọrọ 'National Demographic and Health Survey' na bekee e mere n'afọ 2013 siri gosipụta, n'ala Naijiria, ụmụnwaanyị dị bido afọ 15 rue afọ 19 lụrụ di dị pasentị 28.2, ebe ndị dị afọ 35 rue afọ 39 lụrụ di dị pasentị 89.4. Nke a na-egọsị na ịlụ di bụ omenaala zụrụ agbụrụ ọnụ n'ala Naijiria. Mana ọ bụrụ na nwaanyị etoruo ogo ịlụ di ma ọ lughị, ọkachasị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naijiria, a na-elede ya anya, na-emekpakwa ụfọdụ ahụ, ọtụmadị ihe ha mepụtarala na ndụ. Ginị na akpata ya? Dika ndị ọkammụta n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke a kpọrọ 'sociologists' na bekee siri kọwa, ihe na-akpatakarị mmegbu maọbụ mkpagbu ụmụnwaanyị alụghị di bụ omenaala na enweghị ezi nghọta. N'okwu ya, Dr Adedeji Oyenuga bụ onye na-akụzi 'Sociology' na Lagos State University, kọwara na ọ bụ omenaala nakwa na ụfọdụ ndị nne na nna na-ahụ alụghị di nwa ha dika ihe na-egosi na ha azụghị nwa ha nke ọma. ""O si na omenaala. O nwere oge nwata na-elekwasị nne na nna ya anya, mana mgbe nwata toro bụrụ okenya nọrọ onwe ya, a na-ele nwanwoke anya ịlụ nwaanyị ,na-ele nwanwaanyị anya ịlụ dị. ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ kachasị na ọ bụrụ nwaanyị, nne na nna ya ga-ewe ya dịka na ha akụọla afọ n'ala n'ịzụlite ya."" Dr Nkechi Emma-Echiegu bụ onye nkuzi na Ebonyi State University kwukwara na ọ bụ omenaala. ""N'ala Igbo, ọ na-abụ ajụkata onye mụrụ, a jụwa onye na-alụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ omenaala ọjọọ na a na-akparị maọbụ emegbu nwagbọghọ n'ihi alụghị di. Gee ihe o kwuru n' uju: Dr Nkechi Emma-Echiegu:Ọghọm dị na ikpagbu agbọghọ alụbeghị di'' Gịnị na-ebute alughị di n'oge: Dr Adedeji Oyenuga kwuru na ihe so akpata alụghị di n'oge bụ nwaanyị ịgụ oke akwụkwọ nke nwere ike ime ka ụmụnwoke gara ịlụ ya na-atu ya egwu. Ọzọ bụ na umunwaanyi kariri ụmụnwoke n'ọnụọgụgụ. O kwukwara na ụmụnwoke na-ahapụkarị ebe a mụrụ ha ga mba tere aka karịa ụmụnwaanyị nke mere na ịlụ onye ya na ya tokọrọ na-ara ahụ. Ihe ịkpagbu agbọghọ alụbeghị di na-ebute Dịka ọkachamara Oyenuga siri kwuo, oke megide nwaanyi alubeghị di na-ebute otutu ihe dịka oke mmanya, ịṅụ anwụrụike, ọnwụ ike , oke nchekasị nke ndị bekee kpọrọ,'depression', nke nwere ike ibute ọnwụ ike, ịkwụ ụdọ. Echiegu kwuru na o nwere ike ibute ọdachi dị iche iche gunyere oke echiche, agwa ọjọọ, ịlụ ajọ di, mkpafu na ọnwụ ike. Ha kwuru na ịnwe nghọta ga-enye aka ị kwụsị omenaala ọjọọ nke na-eme ka a na-ahụta nwaanyị alụbeghị di dịka onye enweghị iru ọ bara." afirika-49701829,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49701829,'Ọdighị n'iwu anyị iziga ndị kọpa n'ụlọ ọfụfe' - NYSC,Ngalaba na-ahụ maka iji otu afọ efe ala nna bụ National Youth Service Corps (NYSC) agọọla aka na ụkwu ha maka akụkọ na-efeghari na soshal midia na-ekwu na ha na-eziga ndi ntorobia gaa ụlọụka maọbụ nke ndị alakụba maka ife ala nna ha.,"Ọ bụ ọnụ na-ekwuru NYSC nke Ondo steeti bụ Bankole Simeon kwuru na nke a bụ asi n'ihi na ebe ndi a esoghị na ebe iwu kwuru ka e ziga ndị ntorobịa. O kwuru na onwetubeghị mgbe ndị NYSC ji ziga ndị ntorobia ga ụlọụka maka ife ala nna ha ma si kwa na ha agaghi eme ya eme. Elele okporo ụzọ Babatunde bụ Minista na-ahụ maka ebe obibi na ọrụ Gọọmenti etiti ekewaputala otu narị ijeri naira na ijeri iri isii na isii maka irụ okporo ụzọ ndị gọọment etiti nwe. Okporo ụzọ si Aba gawa owerri, ụzọ NNPC di na Abia steeti ga eri N6.1B ma wee otu afọ na okara iji ruchaa ya. Ọ bụ ụlọọrụ Roudo Nigerial Limited ga-arụ okporo ụzo a. Ebe ụzo Oba-Nnewi-Arondizogu na Okigwe ga-erite elele N12.8B ma wee otu afo na okara iji ruchaa. Ndị ụka Nnamdi Kanu gbakọtara na-ekpere ya ekpere Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob etiela mkpu maka ndị e chere na ha bụ ndị Fulani nọ n'ihu be ya n'Isiama Afara-Ukwu n'Abia steeti. O depụtara nke a site n'akara Twitter ya n'abalị satọde ma na-ekwu na a ga-agba onye ọbụla zitere ha n'anwụ. O boro ndị Fulani ebubo na ji ụgbọala Hilux dị ọcha akpagharị n'ihu be ya. Kanu majara ha na s'ite n'okwu ya na 'ihe ịtụ anya na-eche ndị ahụ'. Nnamdi Kanu: ""Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a"" - Ezinaụlọ na agbatobi ya Ndị mmadụ sara ya okwu na ya bụ Twitter dịka @Forma na-ekwu ka ndị nna nna ya nye ya ike. Ebe Afenifere si ya weta ihe akaebe ịgosi na okwu ya bụ eziokwu. Mpụtara ọgbakọ pụrụiche ECOWAS Onyeisiala Muhammadu Buhari agwaala ndị isi ala ibe ya na mpaghara ọdịda anywanwụ Afrịka ha adana mba na mbọ niile ha na-agba iji hụ na ekpochapụrụ otu ndị na-eyi ndụ egwu n'ala ha. Ọ gwara ha nke a n'ọgbakọ pụrụiche nke ECOWAS hibere n'ụbọchị satode na Burkina Faso. Na mba Tunisia, Onyeisiala Tunisia Beji Caid Essebsi tupu ọ nwụọ n'ọwa Juaị Tunisia na-akwado ịme ntụlịaka nke abụọ ha kemgbe afọ 2011 mgbe ha mere ngagharị iwe chutuo onyeisiala ochie ha bụ Ben Ali. Mmadụ ruru iri abụọ n'isii so na ndị na-azọ ya bụ ọkwa onyeisiala kemgbe Beji Essebsi nwụrụ n'ọnwa Julai afọ a. N'egwuregwu, Callum Wilson nyere goolu premiership nke mbụ ya na Vitality Stadium kemgbe January Ndị otu Bournemouth ejirila ndị otu Everton were zaa aha dịka ha jiọkpụ goolu atọ asatara otu were lee ha ọbịa. Mmeri a bụgotere Bournemouth na ọnọdụ nke asatọ ebe ndi Everton agbadala noro na onodụ nke iri na otu na Premiership. Ebe nkata ndị Watford kpuchiri ndị Arsenal dịka ha satara goolu abụọ ndị Arsenal jiri emeri ha na mbido asọmpi ha. Okagbare gbapụru ọso tupu egbuo opi Otu Athletics federation of Nigeria bụ AFN ahọpụtala mmadụ iri atọ na ise ga-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpị ọgbọsọ mbaụwa niile ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa a. Blessing Okagbare, Divine Oduduru nakwa Rosemary Chukwuma so na ndị ga-aga ya bụ asọmpị. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị a ga-amasị gị:" 43017678,https://www.bbc.com/igbo/43017678,North Korea akpọọla South Korea bia ọgbakọ gbasara udo,Onyeisi ala North Korea bụ Kim Jong-un akpọọla onye isi ala South Korea bụ Moon Jae-in bia ọgbakọ na Pyongyang.,"Kim Yo-jong nyere onyeisi ala South Korea bụ Moon Jae-in akwụkwọ ozi nke Kim Jong-un Nke a bụ ọgbakọ nke mbụ ga-eme na-etiti ha abụọ n'afọ iri. Moon kwuru na mba abụọ ahụ kwesịrị ịhụ na ọgbakọ nke a, ma rịọ kwa ndị North Korea ka ha laghachi na mkparịtaụka gbasara udo na ndị Amerika maka iweta udo. Ọ bụ nwanne Kim Jong-un nwaanyị bụ Kim Yo-jong bụ onye wetara akwụkwọ ozi nke a. Gini ka ndị US chere maka ihe a? Ndị mba US adọọla ndị South Korea aka na ntị maka ọgbakọ nke a. Onye isi ala Amerika bụ Donald Trump na-atụ egwu maka South Korea nwere ike ikweta na omume North Korea na ogbunigwe a na-atụ. Kim na Pence n'ụbọchị nke mbu na Winter Olympics 2018 Ihe South Korea chọrọ Onye isi ala South Korea bụ Moon Jae-in kwuru na ala ha na North Korea kwesịrị ihu na ọnọdụ di mma tupu ha bido ọgbakọ nke a. Moon kwuru na ala ha mara na ọgbakọ nke a di ezigbo mkpa. Ma kwukwa na achọ ka udo di na egwuregwu winter olympics na-eme ugbua na ala ha. Onye bu Kim Yo-jong? Kim Yo-jong bụ nwanne nwanyi onye isi ala North Korea Kim Jong-un. Akụkọ ala kwukwara na ya na Kim dị na mma. Ọ bụ afọ nke garaga ka onye isi ala North Korea kweta na nwane ya ga-abụ ọnụ ga-ekwuchite n'ihe gbasara ọgbakọ ala ha na South Korea." egwuregwu-53123415,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53123415,Brighton vs Arsenal: A pịawaala Arsenal ogbe azụ,Ndị Arsenal hụrụ nwịị n'aka Brighton dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie ha.,"Ndị Brighton nabatara Arsenal n'azụ ụlọ ha, pịa ha ụtalị mmụọ iji gosi ha na ha abịaghị ịchị. Neal Maupay nyere goolu abụọ ndị Brighton na nkeji 90 na ụma, iji kpọnye ntụ n'akpati Arsenal, n'ihe bụ mmeri nke abụọ a na-emeri ha kemgbe a malitekwara Premier League ọzọ. Nicolas Pepe nke Arsenal bu ụzọ nye goolu na nkeji 68, mana Lewis Dunk bịara saa ya na nkeji 75. E bupukwara Bernd Leno bụ Che goolu nke Arsenal, mere ya onye nke atọ (gụnyere Granit Xhaka na Pablo Mari) na-emerụ ahụ kemgbe Arsenal lọghachitere imalite asọmpi Premier League. Cheta na Brighton merikwara Arsenal mgbe ha zutere n'ụkwụ nke mbụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45812359,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812359,Mmọnwụ sụrụ mmadụ mma na asara ọnụ ya n'aka ndị uweojii,Ndị uweojii akparala otu mmọnwụ na onye so ya ha boro ebubo na ọ ha sụgburu otu nwoke dị afọ iri atọ maka okweghị inye ha ego.,"Mmọnwụ ndị Ondo Onyeisi ndị uweojii n'Ondo steeti bụ Olugbenga Adeyanju bụ onye gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu ha nwụchịkọrọ mmọnwụ a n'onye so ya dị afọ iri asaa na ise. Onye a asụrụ mma bụ nwa amadị dị afọ iri ato aha ya bụ Femi Makanjuola. Makanjuola nwụrụ ka ihe mere n'ebe a na-eme emume na Akure, isi obodo Ondo steeti. Uweojii na Ondo kwuru na ọ bụ nwanne onye mmọnwu mara mma aha ya bụ Seun Makanjuola gbara ama maka ihe a mere na ọlụ ọrụ uweojii na ""B"" Division, dị n'Akure. ""Anyi nwụchịrị mmọmwụ a aha ya bụ Olu Oluwokere na otu onye aha ya bụ Adaramola Ajuloko, mana ndị ọzọ aha ha bụ Deji Dada, Danjuma na Sunday Adaramola gbwara ọsọ,"" Adeyanju kwuru, ma tinye na a ga-akpọrọ mmọnwụ a ga ụlọikpe ma ha mecha nchọpụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45041621,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041621,Zimbabwe election: Emmerson Mnangagwa ejirila obere ihe gafee,"Onyeisisala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa meriri ntuliaka eji họpụta, ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru.","Mnangagwa nwetere ihe karị pacenti 50 n'ime vootu atụrụ A gụọla vootu mpaghara iri, nke gosiri na Mnangagwa nwetere pacenti 50 n'ime vootu atụrụ ka Nelson Chamisa nke pati na-anọghị n'ọchịchị bụ MDC nwetere percent 44.. Mana, ndị MDC ekweghị n'ihe ngalaba ntuliaka Zimbawe kwuru, nke mere ndị uweojii ji kpọpụ ha n'ebe a na-agụ vootụ ahụ. Onyeisis MDC sị na vootu ahụ agụpụtara ezighi ezi. Mnangagwa kele ndị nkwado ya na Twitter ma kwuo na mmeri ya bụ ""mmalite ọhụrụ"". Chamisa na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri ntuliaka a, nke mere oji gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tusde na ZANU-PF chọrọ ""ịghọ aghụghọ"", bụ ihe ha ""agaghi ekwe ka ome"". Mana ngalaba Zimbabwe Electorial Commission (Zec) sị onweghi nrụrụ aka ọbula emere. Ndị nkwado Mnangagwa na-enwe aṅụrị Mmadụ isi nwụrụ mgbe ndị na-akwado MDC mere ngaghari iwe n'ụbọchị Wenesde. Ntuliaka bụ nke mbụ Zimbabwe na-eme kemgbe Robert Mugabe pụrụ n'ọchịchị n'ọnwa Novemba nke afọ 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 48886734,https://www.bbc.com/igbo/48886734,Anti malarials abuse : 71% ndị Naijiria-aṅụ ọgwụ ịba enweghị ịba,"Ọtụtụ ndị mmadụ rịawa ọrịa na Naijiria, ha agbara ga zụọ ọgwụ ịba, mana mmadụ ole n'ime ha nwere ọrịa ịba n'ezie?","Nwata a na-agba ọgwụ ba Nchọpụta ọhụrụ nke edepụtara n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na imerime ndị na-aṅụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha ṅụọ enweghi ọrịa ịba n'ahụ ha ma ncha. Onyendu ndị mere nchọpụta a bụ Oche Joseph Otorkpa bụ onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ahụike ọha na Naijiria. Otorkpa na ndị otu ya nyochara mmadụ 470 bụ ndị gara zụrụ ọgwụ ịba na-abụghị dọkịta sị ha zụọ, wee chọpụta na `336 n'ime ha enweghi 'Plasmodium falciparum antigen' n'ọbara ha bụ nje na-ebute ọrịa iba. 'Plasmodium falciparum' bụ nje kacha akpata ọrịa ịba na Naijiria nakwa Afrịka, ebe 'antigen' bụ ihe ga-adị n'ọbara mmadụ nke ga-egosi na mmadụ ariabuola ịba. Ihe ise iba jiri dị iche na taịfọd Nchọpụta ahụ kwuru na mmadụ iji aka enye onwe ya ọgwụ (self medication) jọgburu onwe ya maka na ọ na-eme ka mmadụ na-agwọ ọzọ, ebe ọzọ na-aria ya. BBC Igbo kpọtụụrụ Dọkita Theresa Nwachukwu, onye ọkachamara na ihe gbasara ahụike ọha, o wee kọwaa na nchọpụta ahụ dabara n'anya ya. Nwachukwu kwuru na otu ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organisation' adọọla aka na ntị ka a ghara inye maọbụ gbaa mmadụ ọgwụ ịba ma ọ bụrụ na-ebughi ụzọ nyochaa onye ahụ ma chọpụta na o nwere ịba n'ezie. Anwụnta O kwuru na ""mmadụ iṅụ ọgwụ na-abụghị nke orịa na-aria ya ga-eme ka ọgwụ ahụ ghara ịdịzi ire mgbe onye ahụ ga-ariawa ya bụ ọrịa n'ezie."" ""Ọ dị mma na mmadụ ga-ebu ụzọ gaa nyocha ma chọpụta ihe na-eme ya tupu ọ ṅụwa ọgwụ."" Dkta Otorkpa na ndị otu ya tụpụtara alo wee rịọ gọọmentị etiti ka ha mee ka ụlọinyeọgwụ (pharmacy) niile nwee nke a kpọrọ (Rapid Diagnostic Kits) nke ha ga-eji na-enyocha ndị mmadụ tupu e nye ha ọgwụ ịba. Nchọpụta edere n'akwụkwọ 'Texila International Journal of Public Health' gosiri na mmadụ dị pasentị iri asaa na otu na-aṅụ ọgwụịba enweghi ịba n'ezie. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44255159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44255159,MASSOB: Ịchụgharị Innoson bụ atụmatụ ịchụpụ Ndịgbo n'ahịa,Otu so agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ MASSOB ekwuola na nchụgharị a na-achụgharị onye nwe Innoson bụ Innocent Chukwuma bụ atụmatụ iji chụpụ Ndigbo n'ime ahịa.,"Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra N'akwụkwọ ozi nke onyeisi otu ahụ bụ Uche Madu wepụtara n'Ọka, isiobodo Anambara steeti, ha kwuru na nke a bụ ihe gosiri atụmatụ gọọmentị etiti ịhụ na Ndịigbo gba aka dịka o siri gbasara azumahịa. N'ụbọchị Tọọsde, ụlọikpe nyere iwu ka achụwa Chukwuma. Ha kwuru na ụdị agwa a na-akpaso Ndigbo bụ ụzọ were anya mkpa nnwereonwe Biafra dị. ""MASSOB na-ahụ ihe niile ndị ọrụ nchekwa na-eme Ndigbo dịka atụmatụ iji kpachie ọkpọaka ha dịka o siri gbasa akụnaụba. Anyị na-asị mba nye otu ndị ijide akụnaụba na mmepe obodo Naijiria na-enyeghi ndị Igbo ohere. ""Udi agwa a a na-akpaso Ndigbo bụ ojiegoachuego na ndị hiwere ụlọọrụ bụ agbaama na-egosi mkpa ọdị mbọ anị na-agba maka nwere onwe Biafra."" Otu a kwukwara na Ndigbo ekwenyeghị na mkpebi ụlọikpe sịrị ka a kpụta Innocent Chukwuma n'ihi na ọ bụ imejupụta ebumnaobi 'ndị iro' ọganihụ teknụzụ na-eme na Naijiria site na mmepụta ụgbọala ọ na-eme. Massob boro ebubo na ọ bụ otu a ka e siri kpapụ Cletus Ibeto nke Ibeto group, ma na-achụghari Dr Ifeanyi Ubah nke Capital Oil. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43924091,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43924091,Portharcourt: Anyị anaghị ekuruzi ume ndụ,Gọọmentị etiti kwuru na ha achọpụtala ebe 11 anwụrụọkụ ojii nke na-ekochi obodo Portharcourt siri na-apụta.,"Ọ bụ Mịnịsta ọdịnaala na-ahụ maka ebe obibi bụ Ibrahim Usman Jibril kwupụtara nke a ụnyaahụ na Portharcourt mgbe. O kwuru nkea mgbe ya na ụlọọrụ National Environmental Standards and Regulations Enforcement Agency (NESEREA). O kwuru na gọọmenti na ụlọọrụ ndị ọzọ ga-ejikọta aka ọnụ gbaa mbọ igbochi oke anwụrụọkụ ojii ahụ. Jibril akpọghị aha ebe iri na otu ahụ anwụrụọkụ ndị sị na-apụta. BBC Igbo gbara mbọ innweta ndị ụlọọrụ NESEREA na kọmishịọna na-ahụ maka gburugburu obodo onweghị onye zara. N'ime ihe ruru afọ ise ugbua, ndị bi na Portharcourt nọ zi n'ụjọ ahụike ha maka anwụrụọkụ ojii a. BBC Igbo gbara otu nwaanyị na-azụ ahịa na Portharcourt akpọrọ Mercy Ekwu Nkuma ajụjụ ọnụ n'ekwentị. O kwuru na anwụrụokụ ojii ahụ sị n'ọdọ ebe a na-esi mmanụ akpọrọ 'kpofire'. Mercy kwuru na anwụrụọkụ ojii a ekogbuola ha, na ndị bi na Portharcourt a naghị ekuzi ume ndụ. Mercy rịọrọ ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ enyemaka tupu ngwa ngwa. Gere ihe o kwuru ebe a: Anwụrụọkụ ojii ekogbuola anyị" 44036850,https://www.bbc.com/igbo/44036850,Njem Buhari: Ndị Naịjiria etinyela ọnụ na okwu,Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gawa Lọndọn dịka dọkita ya gwara ya bịa maka nyocha ahụike ya.,"O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Buhari ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na njem ya. Nke a na-esote njem o mere n'afọ gara aga ebe ọ fọrọ nwa obere ihe ka ọ nọkarịa mkpụrụ ụbọchị 100 nke butere ndọrịtaụka gbasara ihe akwụkwọ iwu kwuru. Ugbua, o kwuru na ya ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ mana ụfọdụ ụmụ Naịjirịa anabataghị ya bụ njem nke ọma. Ọtụtụ n'ime ha rụtụrụ aka n'okwu ya na mbụ ebe ọ gwara ndị ụlọ Chatham na Lọndọn na ya agaghị eme njem ahụike maka na ya ga-arụzị ahụike na Naịjiria. Onye kpọrọ onwe ya Slim Berry na Twitter, wepụtara akụkụ akwụkwọ ebe Buhari kwuru ihe a n'akwụkwọ ọ gụpụtara na Chatham n'afọ 2015. End of Twitter post, 1 Onye kpọrọ onwe Whyte n'akụkụ nke ya na-ajụ ihe kpatara na Buhari kwuru na ya agaghị eme njem gaa mba ofesi na-atụfụ ọtụtụ ego na ya. N'akụkụ nke ya, Hayatu kelere onyeisiala Buhari na ọ na-agbalị ịchị Naịjirịa agbanyeghi etu ahụ ya dị ya. N'akụkụ nke ya, Precious kwuru na ọ bụrụ na Buhari enweghi ike imezi ụlọọgwụ onyeisiala dị n'Abuja, kedụ etu ọ ga-esi mezie ahụike na Naịjirịa. Ọ jụkwara ha ihe kpatara o jiri chọọ ịzọ ọchịchị ọzọkwa n'afọ 2019 ma o meghi ihe ndị o kwere na nkwa. Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Okey Odogwu kwuru na ọ dị mkpa na onyeisiala dịka mmadụ gara nata ahụike. Mana o kwuru na njem ya akarịala ma bụrụ nsogbu na Naịjirịa karịa asịsa nye nsogbu ụmụ Naịjirịa. N'okwu ya, ""Nsogbu ụmụ Naịjirịa karịrị nke ahụike onyeisiala ekwesighi iso na ya mana mmadụ kwuo, a sị na ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị. ""Onyeisiala akatala ahụ, o kwesiri ị na-arịa ọarịa, mana ihe ọ kara ime bụ iji aka ya jiri nwayọọ ritue ma la ezumikenka n'onwe ya."" Onye ọnụ na-eru n'okwu N'aka nkeọzọ onyeisi ndị APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na ndị na-ajụ ihe onyeisiala na-emere njem maka ahụike ya bụ ndị omekome na ndị PDP. Nwoye kwuru na Buhari bụ agadi nwoke kwesiri ileta onwe ya anya ma na enyefekwa osote ya ọchịchị ma ọ chọọ ime njem. Nwoye sị, ""Ndị na-ekwu ihe a bụ nd i a napụrụ ọchịchị na-ebe akwa na-anara ha ọchịchị. ""Buhari na-enyefe osote ya ọchịchị ma ọ chọrọ ịga ebe ọbụla, nke a gosiri na ọ na-eme ihe ziri ezi maka na ọ gwara ụwa niile na ya ejighi ahụ."" Onyeisi APC n'Enugwu Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44755783,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755783,Ima aha ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuru na aka ha dị na oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa?,Femi Adesina si na onweghị ihe onwere ikwu gbasara akwụkwọ onye otu ya bụ Garba Shehu depụtara maka nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehị.,"Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. O nyere usaa a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ taa. Na mbụ, onye ndụmodụ ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi n'ụlọọrụ onyeisala Naịjịrịa bụ Shehu Garba deputara okwu a n'akwụkwọ o wepụtara ụbọchị Julaị 8. N'ime akwụkwụọ ahụ o kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchichị a na-akpọpụtaghị aha ha na-eji ndị ekperima eme oke ogbugbu a. Shehu kwukwara na mgbanwe ịhụ igwe nakwa nkpọnwụ ''Chad Basin'' sokwa eme ka nsogbu oke ogbugbu a bawanye. O kwere nkwa na gọọmentị etiti na-agba mbọ n'ịhụ na ya bụ nsogbu nwetere ogbugbo tọrọ atọ. Shehu rịọkwara ndị Naịjirịa na ndị mba ofesi ka ha kwụsị gbasa ozi ụgha gbasara nsogbu a. O kwuru na o dimkpa ka ndị na-achị steeti, ndị ọrụ nchekwa, na mba ofesi jịkọta aka gboo mkpa a. N'ọnụ ya, nsogbu ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ụgbo bụ ihe diwara kamgbe gboo. Ihe na-ebute ya bụ miri emi.'' Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: Patrick Ibeawuchi kwuru na o chere na onyeisiala kwuburu na ọ bụ ndị oyi egwu Libya na-ebute nsogbu a? Elisha Bello na-agwa onyeisiala ka o nwuchie ndị a o na-ekwu nwere aka na nsogbu ochiehi na ndị ọrụ ugbo. Shyne na-agwa ụlọọrụ onyeisiala ka ha kwusi ị nye usaa kpatara nsogbu kama ha chọọ ogbugbo ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48751910,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48751910,Nnamdi Kanu: Ihe mere o ji jiri eluigwe tunyere Biafra,Paul Achalla bụ ọkaiwu otu Ipob ekwuola na Nnamdi Kanu ga-abia Naịjirịa bia zara ọnụ ya n'ikpe gọọmenti etiti kpụpụrụ ya ma ọ bụrụ na ọ hụ na Naịjirịa adịla njikere ikpe ya bụ ikpe.,"Mana ụwa ka na-ajụ ma ọ bụzị mmadụ na-ekwu onye ga-eje eligwe na onye na-agaghị eje? Nke a na-eme dịka onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuchara na onye ọbụla na-akatọ Biafra agaghị aga eligwe makana ọ bụ asụsụ Igbo ka ndị mmụọozi na-asụ ebe ahụ. Gere ya ebe a: Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere Mana Paul Achalla bụ ọkaiwu otu Ipob kwuru na ya bụ okwu bụ eziokwu. Achalla kwuru na onye Naịjirịa ọbụla na-emegide ndị chọrọ nnwereonwe ha agaghị aga eligwe makana eligwe kpọrọ onye ọ bụla na-emegide mmadụ ibe ya asị. N'ọnụ ya, ""Ihe a Nnamdi Kanu kwuru dị n'akwụkwọ nsọ ebe Chukwu kwuru na onye ọbụla gbara mmadụ ohu kwesiri ka ọ hapụ onye ahụ ma afọ asaa ruo."" A na-asụ asụsụ Igbo n'eligwe dịka Nnamdi Kanu si kwupute? Achalla kwuru na asụsụ Igbo bụ asụsụ eligwe makana ọ bụghị asụsụ mmegide ya bụ ndị eligwe na-akpa asụsụ dịka agwa. Nnamdi Kanu ka na-eme njem Achalla kwuru na Mazị Kanu ka na-agagharị na-eme njem ịgwa Ndigbo niile bi na mba ụwa uru Biafra baara ha ma ha nweta ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52985198,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52985198,Burundi President: E liela Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi,Taa bụ Fraide ka e liri Pierre Nkurunziza bụbu onyeisiala mba Burundi n'obodo Gitega.,"Nkurunziza chịrị mba Burundi afọ iri na ise tupu ọ nwụọ site n'ọrịa 'mgbachi obi' izuụka abụọ gara aga, dịka gọọmenti mba ahụ siri kwuo. A na-ebo Nkurunziza ebubo ọchịchị nchigbu mana ọrụụ ọrụ pụụ iche n'ahụike dịka o hiwere atụmatụ ụmụnwaanyị dị ime na ụmụaka erubeghị afọ ise ịnata nleta n'ụlọọgwụ n'efu. Mana ọ gbara ọnyụpa n'ọgụ megide coronavirus dịka ọchịchị ya ejighị obi dimkpa lụọ ọgụ ahụ. Burundi ewepụtela ụbọchị asaa iji ru uju maka onyeisiala ha Onyeisiala Burundi, Pierre Nkurunziza Mba Burundi ewepụtala ụbọchị asaa iji ruo uju maka onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza. Mana ndị ọchịchị obodo ahụ na-ekwusi ike na ọbụghị ọrịa coronavirus gburu ya, ma dọkwaa aka na ntị ka ndị mmadụ zeere asịrị dị otu a. Nke ka njọ ugbua bụ na ọnwụ Nkurunzịza etinyela Burundi n'ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme. Nwunye ya bụ Denise Nkurunziza butere ọrịa coronavirus. Akụkọ na-ekwu na ọ gara mba Kenya ga nweta ọgwụgwụ ma mechaa lọghachi. Akụkọ na-ekwukwa na onyeisi ụlọ omeiwu Burundi bụ Pascal Nyabenda na-arịakwa ọrịa Covid-19. Dịka iwu Burundi sị dị, ọ bụ Nyabenda kwesịrị ịnọchi onyeisiala ma a chọọ ya achọọ. Evariste Ndayishimiye, bụ onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere na Burundi n'ọnwa gara aga, nwekwara ọrịa coronavirus, dịka akụkọ ụfọdụ si kwuo. Mana odochaghị BBC anya ma ya bụ akụkọ ọ bụ eziokwu. Gọọmenti mba Burundi kwupụtara ọnwụ onyeisiala ha bụ Pierre Nkurunziza n'ụlọọgwụ dị na Burundi n'ụbọchị Mọnde. Ha kwuru na Nkurunziza onye gbara afọ 55 gbabiri nwụọ site n'ọrịa njide obi (cardiac arrest) dịka ebugachara ya n'ụlọọgwụ Karusi nke dị nso n'ụlọ ya n'ụbọchị Satọde. Kepukepu kwuburu na nwunye Nkurunziza buteburu ọrịa coronavirus, akụkọ Nkurunziza ekweghị ka ntị nụ, kama haziri ntuliaka ka ọrịa ntuliaka dịka ọrịa dịka ọ chụpụrụ ndị ọrụ WHO n'ala ha. Dịka gọọmenti mba ahụ si kwuo, a ga-eme emume ọkwụkwa ya abalị asaa bido taa bụ Tuzde. Nkurunziza bidoro ịchị Burundi kemgbe afọ 2005 na-achọbu inyefe ọchịchị n'aka onye meriri na ntuliaka e mere bụ Evariste NDayishimiye n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2020. Ihe iri i kwesiri ị ma maka Nkurunziza Onyeisiala Burundi bụ Pierre Nkurunziza eferela ụwa a aka ka ọ dị afọ 55 6. Ngagharịiwe so mbọ ọ gbara iji banye ọchịchị agba nke atọ ya n'afọ 2015 tara isi puku kwuru puku ndị mba Burundi. 7. Ọtụtụ gụnyere 'Human Rights Watch' katọrọ ya maka mmegide ikike dịrị onye dịka inwụchi ndị mmadụ aghara aghara, ogbugbu ndị mmadụ na-agbasoghi iwu,iti ihe na mkpagbu ndị ọzọ. 8. Ọ tụrụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ mkpọrọ. 9. Nkurunziza, 'onye chegharịrị e chegharị' lụrụ nwaanyị aha ya bụ Denise, onye ya na ya ji ụmụ ise. 10. Ọ gara erite nnukwu ụlọ na ego dị ijeri dọla $540,000 oge gara aritu n'ọnwa Ọgọstụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-a masị gị:" afirika-49355341,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355341,Rev Father Mbaka: Ndị chọrọ ka Buhari nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ,Ụkọchukwu Ejike Mbaka bụ onyeisi ụka Adoration dị n'Enugwu ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa.,"Mbaka kwuru nke a ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ofufe nru ọ na-ehiwe kwa izuụka n'ogige Adọration dị n' Umuchigbo Iji-Nike, Emene, Enugwu. Fada Mbaka sị na o ruru afọ 16 ndị chịburu Naịjirịa mbụ ji mebicha obodo ma kwukwaa na ndị mmadụ chọziri ka Buhari jiri afọ ole na ole mezie ihe niile. ""Ndị mmadụ na-akọ m ọnụ na m na-akwado Buhari ka a ga-asị na Buhari adịghị eme ọfụma."" Mbaka gara n'ihu sị na ọchịchị Buhari ga-adị, na ndị chọrọ ka ọ nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ. Ọ sị na ya ma na ọ bụ Buahri nọ n'Asọ Rock makana ọ na-echeta nkata ha abụọ kpara tupu ọ bụrụ onyeisiala. N'okwu banyere ndị na-achi ehi, Mbaka sị na ya nwere ehi, nke mere ya onye ọchịehi. Lee ihe 20 gbara ọkpụrụkpụ ndị ọzọ o kwuru n' ozi ya: Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa 1. Buhari abụghị nsogbu anyị, ndị Buhari bụụrụ nsogbu bụ ndị na-ezufu ego 2. Buhari abụghị nsogbu Ndigbo. Kedụ mgbe Buhari banyere n'ọchịchị Naịjịria? 3. Jonathan enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Obasanjo enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Ken Nnamanị bụ onyeisi Sineti, o nyere ụnụ Biafra? 4. N'ọrụ ugbo, Naijiria na-alaghachi ugbua na ị bụ ebe e jiri ịkọpụta ihe ubị mara n'Afrịka 5. Ihe e mebiri n'afọ 16, agaghị edozili ya n'otu afọ 6. Onye bụbụ Mịnịsta Mmanụ bụ Dieaziani ọ bụ na ọ bụghị onye Igbo na-alụ ya? 7. Ndị gọvanọ chọọ ụzọ ha ga-esi gboo mkpa nchekwa na steeti ha, ọ bụghị Buhari ga-abịa gburu gị anwụ. 8. E kwuru m ka a ghara ime ngagharịiwe maka Fada Offu e gburu ma ọ bụrụ na e meghị nchọpụta ka e were hụ ihe a gbadoro ụkwụ. 9. Esonyeghị m mee ngagharịiwe n'agbanyeghị na m bere akwa maka ogbugbu ya. 10. Ndị wepụtara foto sị na ọ bụ m ebe m so eme ngaharịiwe maka ogbugbu Fada Paul Offu ga-ata ahụhụ. 11. E nwere ndị Fulani bụ ndị ajọ mmadụ na-ememila ndị mmadụ mana ha abụghị ndị ọchịehi. E nwekwara ndị ọchiehi na-eme ihe ọjọọ, 12. E nwekwara ndị Igbo bụ ajọ mmadụ bụ ndị ntọ, ọ bụghị naanị ndị Fulanị 13. Anyị nwere nnukwu nsogbu nke ihe ga-egbo ya bụ inwe ọrụ. 14. Ụfọdụ ndị gọvanọ ga-ezufucha ego, ha agaghị akwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ. 15 Gọvanọ ọbụla bụ onyeisi nchekwa steeti ya, ha na-ata ego nchekwa kwa ọnwa maka nke a. Kedụ ihe ha ji ya eme? 16. Ndị uweojii na-ejichi ndị Keke na-anapụ ha ego n'ike ọ bụ Buhari na-eme nke a? A na-eme ya n'Ugwu Awụsa? 17. Bịafra, Bịafra, enye Ndigbo Bịafra ugbua, a sị anyị nweta onyeisiala, ndị Anambara a ga-ekwe ndị Imo? Ndị Imo aga-ekwe ndị Enugwu? Ndị Enugwu aga-ekwe onye Ebonyi? Abịa aga-ekwe Imo? 18. Ọ bụrụ na m bụ Ịmam ndị Ugwu, ndị Ugwu ga-echekwa m. Ọ bụrụ na m bụ ụkọchukwu ndị Ọdịda Anyanwụ, ndị Yoruba ga-echekwa m. Igbo nwere eze na-egbu onwe ha. 19. Ha chọrọ igbu Fada Mbaka ka ha bo ya ndị Fulani. 20. Ndị na-eti Biafra Biafra na-egbu oge ụnụ, na-anapụ ụnụ ego. 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48886733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48886733,AFCON Round of 16: Benin Republic emeela Morroco akwụrụ echewe ụwa,"Igbo tụrụ ilu sị na elelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ, nke a bụ eziokwu.","Ọgba bọọlụ Morocco bụ Hakim Ziyech gbafuru penariti ya Mba Morocco ji anya ha wee hụ nke a taa dịka mba Benin Republic gbaara ha ụgbọnwamkpi n'asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON 2019. Morocco na Benin Repụblic nyere onwe ha otu goolu otu goolu nke mere ka asọmpi ahụ baa na penariti. Ndị Benin Republic dị naanị mmadụ iri wee gbachaa ya bụ bọọlụ n'ihi 'Red card' e nyere otu n'ime ha. Ndi egwu bọọlụ Benin Republic nọ n'aṅụrị Penariti ahụ mechara bie mgbe Benin Republic nyere Morocco goolu anọ asatara naanị otu. Nke a pụtara na Benin agafeela na agba nke ọzọ AFCON 2019 ebe Morocco eberela akwa lawa. Ọ bụ nke izizi Benin Republic na-abanye agba nke atọ AFCON. Ka ọ dị ugbua, mba Senegal na ndị Uganda na-achịpụ ya iji mara onye ga-agafe na agba nke ọzọ. Ndị Super Eagles nke Naijiria ga-ezute mba Cameroon echi bụ Satọdee n'elekere ise nke uhuruchi. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54551737,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54551737,Mmanụ nri na ihe ndị ọzọ a a na-emebi nsị n'ezie?,O nwere ọgụgwọ gbatagbata dị icheiche ndị Igbo ji agwọ mmerụ ahụ nakwa iri nsị tupu e nweike nye mmadụ ọgwụgwọ juru afọ kemgbe ụwa gboo.,"Ụfọdụ n'ime ha gụnyere mmanụ nri, aki ilu, akwụ ojukwu, akụoyibo, mmiri nnu nakwa ahịahịa dị icheiche. Mana kedụ ụdịrị ike ihe ndị a nwere n'ebe ọgwụgwọ nke Bekee nọ? Ọ bụ eziokwu na mmanụ nri na-azọ ndụ onye riri nsị? Dọkịta Nkolika Nwankwo kọwara na ọgwụgwọ gbatagbata ọbụla a na-enye onye ṅụrụ maọbụ rịe nsị metụtara ihe atọ: Lekwa ihe anyị chọpụtara dịka anyị gbara otu onye dibia mgbọrọgwụ na dibia Bekee ajụjụ ọnụ gbasara ihe ndị a. Mmanụ nri Otu onye ma anya mgbọrọgwụ ndị Igbo ji agwọ onwe ha kemgbe oge gboo bụ Duruagwu nke abụọ gwara BBC Igbo na mmanụ nri bụ otu ihe eji agwọ nsị O kwuru na ya na ụfọdụ ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị Igbo na-enye mmadụ gbatagbata tupu e nweike gwọọ onye ahụ ọfụma. N'otu aka ahụ Dọkịta Nkolika Nwankwo gwara BBC na o nweghi ihe akaebe gosiri na mmanụ na-azọ ndị onye riri nsị O kọwara sị ""mmanụ nwereike ịkpuchi anụ ahụ dị n'ime afọ mmadụ maka etu o si lọọ alọ nke ga-eme na ọ bụrụ na mmadụ rie maọbụ ṅụọ nsị, naaanị afọ nkịtị ga-asa ya maọbụ ọ gbọọ agbọ Mana ọ bụrụkwa maka ịgbu nsị dị n'ime ahụ mmadụ, ọ naghị eme nke a. Akụoyibo Duruagwu kwukwara na e ji mmiri akụoyibo agwọ ndị riri nsị n'ụzọ ọbụla ọ bụ. O kwuru na ihe mmiri akụoyibo ji dị mkpa bụ na ""o nwere anya atọ nke ndị ichie na ndị amosu na-eji ele anyị anya"". Mana Dọkịta Nwankwo kwuru na o nweghi ihe akaebe n'ọgwụgwọ Bekee gosiri na akụoyibo maọbụ mmiri na-agwọ onye riri nsị Kama ọ kọwara na mmiri akụoyibo na-enye ike n'ihi na o nwere ihe sayensị kpọrọ ""electrolytes"" na-enye mmadụ ike. O kwuru sị ""ikekwe onye riri nsị na-agbọ agbọọ, ike ga na-agwụ ya mana enye onye ahụ mmiri akụoyibo, ọ ga-eme ka ahụ situ ya ike mana ọ gaghị emebi nsị onye ahụ riri"" Aki ilu Ihe ọzọ Duruagwu kpọpụtara e ji agwọ nsị enyere mmadụ bụ aki ilu maọbụ ugoro. Dọkịta Nwankwo kwuru na nke a abụghị eziokwu n'ihi na aki ilu bụ mkpụrụ osisi nọrọ onwe ya. ""A ghọtara m na ụfọdụ ndị ọdịnala kwenyere n'ike aki ilu nwere mana ahụtabeghị m ebe o gwọrọ onye riri nsị na ndụ m chaa chaa"" ka o kwuru. Ihe ndị ọzọ pụtara n'okwu a Duruagwu kwuru na o nwere ihe Igbo na-akpọ udu nke a na-enye onye riri nsị iji zọọ ndụ ya. O kwuru na ọ na-eme ka onye ahụ gbọpụta nsị ahụ o riri. Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ihe ndị a na-etinye n'ime udu ahụ o kwuru na ọ bụ: akwụ ojukwu dị ndụ, mmiri nkịtị dị ọcha, aki ilu na mkpụrụ anya nnụnụ ndz. O kwukwara na o gaghaị akpọpụta ihe ndị dị n'ime udu ahụ n'ihi na ọ pụtara ịgba ama n'ọrụ aka ya. Unyi nkiti (Activated charcoal) Dọkịta Nwankwo kwuru na ihe ụlọọgwụ niile ji agwọ ndị riri maọbụ ṅụọ nsị bụ ụnyi nke Bekee kpọrọ ""Activated charcoal"" O kwuru na ọrụ ya n'ime ahụ bụ ịkpuchi nsị ahụ ka ọ ghara ịmetụta ime ahụ mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ n'ime ahụ rue mgbe mmadụ ka anyụpụ ya. ""O metụtakwara oge e ji bute onye ahụ n'ụlọọgwụ maọbụ chọpụta na onye ahụ riri nsị n'ihi na ka oge na-aga, ka ọrụ unyi ahụ nwereike ịrụ n'ime ahụ na-agbada"" Ihe ọzọ o ji ma atụ eji agwọ ndị riri maọbụ ṅụọ nsị bụ ịsachapụ afọ mmadụ nke bụ ""stomach pumping"" na Bekee. Etu e si mee ya bụ ịwunye mmadụ mmiri dị ọcha n'afọ ma mipụtakwa ya n'iji paịpụ e si n'ime imi mmadụ tinye n'ime afọ. Usoro ịsachapụ ime afọ abụghị nsị niile ka-eji ya agwọ n'ihi na o nwere ụfọdụ kemịkalụ siri ike ga-emerụ mmadụ ahụ ma a nwaa iji usoro ahụ ewepụta ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45109002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109002,National assembly: Ihe nkiri na-eme n'ụlọomeiwu sineti ka kpụkwa ọkụ n'ọnụ.,Ndị sịnetọ ruru iri anọ n'itoolu e binyela aka n'akwụkwọ iji hụ na achụtughi ndịisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa.,"Otu dị iche iche aputala ị kwu na ha akwadoghị nchutu Saraki na Ekweremmadu Ọtụtụ ndị sịnetọ si na otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ PDP so na ndị binyere aka n'akwụkwọ a. Akwụkwọ ahụ gụpụtara ihe ndị a,""Anyi bụ ndị sinetọ binyere aka n'akwụkwọ a na-ekwupụta oke nkwado anyi na-ebe onyisi ụlọomeiwu ukwu bụ Saraki na Ike Ekweremadu dika ndị isi anyị."". ""Anyị e kwenyeghị na nchụtụ ọ bụla ụfọdụ ndị otu anyi na-akwado ime ha.'' Cheta na akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị sinetọ otu patị APC na-akwado ị chutu Saraki and Ekweremadu mana ndị sinetọ otu patị PDP nụchatara ya ma gba mbọ n'agbanyeghị na ha nọ ezumike bịa ghasasia ya bụ nzụbe. Ndị fụrụ ekpo na-egbochi ndị mmadụ ịbanye n'ụlọomeiwu Naịjirịa Na mbụ, ndị ọrụ nchekwa akpọrọ DSS kpuchiri ihu ha ekweghị ka ha banye n'ụlọọrụ ha mgbe ndị sinetọ APC zukọrọ mana ha mechara banye. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47053607,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47053607,Onye tọọrọ onyeisioche pati APC nke ndị Abia steeti?,Ndị uweojii nọ n'Abịa ekwuola na ndị ntọ atọrọla onyeisioche pati APC bụ Donatus Nwamkpa na steeti ahụ.,"Atọọrọ Nwamkpa na mgbede ụbọchị onyeisiala gara Abia maka achụm nta vootu. Ha kwuru na ọ bụ sọ ọkwọ ụgbọala Nwamkpa gbalarịrị ndị ntọ ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti Abịa bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na a tọrọ Nwamkpa n'elekere itoolu nke mgbede ụbochị Jenụwarị iri abụọ na itoolu. Ogbonna kwuru na a tọọrọ Nwamkpa n'ụzọ korota Aba dị n'Isialangwa. O kwuru na ka ọ dị ugbua, na ya na ndị otu ya ka na-eme nyocha ka ha mara ebe ha tọọrọ Nwamkpa gaa ka ha nweeike gbapụta ya. Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari gara achụmnta vootu na steeti Abia ụnyaahụ bụ Tuzde. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55223881,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55223881,Ọgba Mbọ: Eji m osisi dịka nkụ arụpụta ihe ọgbara igbo gharịị - Samson Ejiofor,Akaraka dị n'iche n'iche dịka chi onye si nye onye.,"Nke chi Samson Ejiofor nyere ya bụ iji osisi dịka nkụ arụpụta ihe mara mma. Nke a bụ ụzọ o ji agbara onwe ya mbọ ma na-akpata ihe afọ ya ga-eri. Ejiofor kọọrọ BBC Igbo etu o si malite, ihe ọ na-agabiga n'ọrụ ya nakwa ihe ọ na-elegara anya maka ọdịnihu. Lee ihe nkiri ya n'elu. Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Nnamdi Agbanelo na Chimezie Uche-Agbo Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-50619970,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619970,Tax Identification Number: I nwetela nke gị?,"Tupu ị nwee ike ịdọrọ ego n'ọba ego gị bido n'ọnwa Jenụwarị 2020 gawa, ị ga-egosi na ị na-akwụ ụtụisi gi.","Nke a bụ nke na-efegharị na soshal midia ma na-ekwukwa na atụmaatụ a so n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu ukwu wepụtara n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa November, 2019. Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi BBC Igbo gbalịrị ịnụta n'ọnụ ndị ọrụ ngalaba mmefu na mkpata ego Naịjirịa bụ ""Ministry of Finance, Budget and National Planning"" gbasara ya bụ atụmaatụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Anyị gakwara n'akara twitter ha ma chọpụta na ya bụ iwu gafere ogo nke ngụpụta atọ, na-echezi ka onyeisiala binye aka na ya. Mgbe BBC Igbo jụrụ ndị ụlọ ọrụ 'Federal Inland Revenue Service,' otu onye na-anọ n'oche nnabata ha gwara anyị na ya bụ atụmaatụ erubeghị ha ntị. Anyị jụkwara ọnụ na-ekwuru ndị ụlọakụ Fidelity bụ Ejike Ndiulo maka ya bụ atụmaatụ, o kwuru na ozi ahụ erubeghi ha ntị. Mana gịnị bụ Tax Identification Number? Nke a bụ akara ndị ụlọọrụ ụtụisi na-enye mmadụ maọbụ ụlọahịa nke ga-abụzi njirimara ha mgbe ọbụla ha chọrọ ịkwụ ụgwọ ụtụisi. Ihe ndị ọzọ ikwesiri ịma maka TIN - I ga-enweriri akara Bank Verification Number(BVN) nakwa akwụkwo njirimara nke mba Naịjirịa. - Ihe mere i ga-eji nweriri akara TIN bụ maka iji gosi na ịbụ nwafọ Naijirịa maọbụ ụlọahịa na-akwụ ụgwọ ụtụisi. - A naghị akwụ ụgwọ maka idebanye aha iji nweta TIN mana ọ bụrụ na ị si n'aka ndị ọsọ ahịa, ọ ga-eme ka ịkwụọ ụgwọ. - A na-eweta ya ozigbo imechara usoro eji enweta ya mana ụfọdụ oge o na-ewe ihe ruru abalị abụọ iji pụta. Ihe ndị a bụ dịka ụlọọrụ Joint Tax Board si depụta n'akara webụsaịtị ha. Akụkọ ndị ga-masị gị" afirika-44725337,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44725337,Nchụda Buhari: Lee usoro isii ụlọomeiwu ga-eso,"N'ụbọchị Wenezde abalị 4 ọnwa Julai, ụlọikpe ukwu dị n'Oshogbo nyere ụlọomeiwu iwu ibido usoro ịchụda Muhammaduụ Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala Naijiria ozigbo.","Nnọkọ ụlọomeiwu ukwu na nta dị mkpa n'ịgbaso usoro ịchụda onyeisiala Ebe ụfọdụ ndị ọkaiwu dịka Chijioke Ike na-ekwu n'iwu ahụ ụlọikpe ahụ nyere bụ ihe ziri ezi n'ihi ihe ha chere bụ na onyeisiala emetala ihe zuru ka a chụda ya, ebe ụfọdụ dịka Godstime Okafor na-ekwu na mbọ ahụ agaghị amịta mkpụrụ n'ihi na ""mkpi mbugota anaghị agba, n'ihi na n'onwe ha ndị omeiwu achọghị ịchụda onyeisiala."" Na mkparịtaụka ha na BBC nwere n'ekwentị, ọkaiwu abụọ a bụ Okafor na Ike kọwara na ọ bụrụ na onyeisiala metara ihe gafere ikike iwu Naijiria nyere ya, usoro e kwesiri igbaso dịka ọ dị n'iwu Naijiria iji iwepụ ya n'ọchịchị. Lee usoro ndị ahụ : 1. Ha ga-edepụta ya Ndị ụlọomeiwu ga-edepụta ihe ndị onyeisiala mere o jiri mejọọ iwu nke, Ọkaiwu kpọrọ 'Catalogue of Impeachable offence' na bekee 2. Ha ga-edegara ọkaiwu ukwu Naijria(Chief Justice of the Federation) akwụkwọ Ọkaiwu Okafor kọwara, ""Ọ bụrụ na abụọ n'ime ụzọ atọ ndị ụlọomeiwu binye aka n'akwụkwọ ndepụta ihe ọjọọ onyeisiala mere megide iwu, ha ga-ezigara onye ọkaiwu ala anyị ozi ahụ 3. Onyeọkaiwu ukwu ahụ ga-ehibe kọmitii Ọ bụrụ na onye ọkaiwu kachasị nata ozi ndị ụlọomeiwu, ọ ga-ehibe kọmitii ga-eleba anya iji mara ma onyeisiala o mere ihe ndị e boro ya n'ebubo 4. Kọmitii ga-enyocha ebubo ndị a Kọmitii ahụ ga-enyocha ebubo ndị ahụ ma wepụta mpụtara nyocha ha n'ime abalị asaa. Ọkaiwu Ike kọwara na, 'Tupu nke a emee, kọmitii ahụ ga-akpọ onyeisiala oku ịzara ọnụ ya. 5. Kọmitii ga-ezighachi ọkaiwu kachasị mpụtara nyocha ha Ọ bụrụ na kọmitii enweghị ihe ha chọpụtara, okwu ahụ ga-ebe, usoro nchụda agaghị enwekwa isi, ị mara na a ga-ekpofu okwu ahụ n'ọhịa 6. Nchụda onyeisiala e biri ọkụ Ma ọ bụrụ na mpụtara nyocha kwuru na onyeisiala mere ya, ị mara na atụmatụ ahụ ga-enwe isi Ihe na-eso ya bụ nnọkọ ụlọomeiwu ukwu na ụlọomeiwu nke nta Ọkaiwu Ike kwuru na ""ebe a ka ha ga-anọ gụpụta mpụtara nyocha kọmitii. Ọ bụrụ na nchọpụta ha kwuru na onyeisiala mere ihe ahụ, mgbe ahụ ha a chụọ ya n'ọrụ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51267094,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51267094,Virginity Repair Surgery: 'Kwụsịnụ ịrụgharị ọtụ ụmụnwaanyị',"Ndị ọkacha mara na-arịọ ka gọọmentị kagbuo nrụgharị ọtụ nwaanyị nke a kpọrọ ""virginity repair"".","Enwere ụlọọgwụ ruru 22 na-awa ọtụ nwaanyị na Briten Ihe dịka n'ofufe maọbụ n'omenala ndị ọzọ, e nwere ike igbu nwaanyị ma ọ bụrụ na di ya maọbụ ndị ezinụlọ ya chọpụta na ya na nwoke emekọọla tupu ọ gbaa akwụkwọ. Nke a mere ka ọtụtụ n'ime ha na-agakwu ndi dọkinta ka ha rụgharịa ihe ha jiri bụrụ nwaanyị ka ọ dị ka onwebeghi nwoke gara na ya. Nrụgharị a bị iji mechie ihe na-ekpuchi otụ nwaanyị amanghị nwoke nke bekee kpọrọ 'hymen'. Mana, a na-atụ ụjọ na ịmachị omume a nwereike tinye ndị mmadụ na nsogbu site n'ịchụba ha na nzuzo. Otu a kpọrọ ""General Medical Council"" (GMC) na Bekee sị na ọ bụrụ na a na-eche na onye chọrọ ime ụdịrị ihe a na-eme ya maka na mmadụ na-eyi ya egwu, ọ bu oge ahu ka a ga-ajụ ajụjụ. ""Ibi n'ujọ"" Halaleh Taheri, bụ onye hibere ngalaba ""Middle Eastern Women and Society Organisation"" kọọrọ BBC maka otu nwata akwụkwọ Moroko na-ezogharị na London dịka ọ nụrụ na nna ya akwụọla mmadụ ụgwọ ka egbuo ya. Ka ọ gara mba Briten n'afọ 2014 ị gụ akwụkwọ, ya bụ nwaanyị di afọ 26 ugbua lakwuuru otu nwoke ha abụọ e biri. Mana ka nna ya chọpụtara nke a, ọ gwara ya lọta Moroko, wee kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ ebe a chọputara na ọ matala nwoke. Ụmụnwaanyị ofufe alakuba ji maka ihere eme ihe a, ndị na-ahụ maka mmegide kwuru Nwa ada ahụ gbalara London mana o bizi n'ụjọ na nna ya nwereike chọpụta ebe o bi. Otu onye Moroko di afọ 40 sị na ya mere ụdịrị ihe ahụ oge ọ dị afọ 20 na ụma, mana ọ agaghị ekwe ka umu ya mee ụdịrị ihe a. ""Agaghi m eme ha ụdịrị ihe a ma ncha. A ga m akụzịrị ha ka ha bie ndu etu ha si chọọ."" Abalị agbamkwụ Enwere ihe ruru ụloọgwụ 22 dị na Briten na-eme awamahụ ikpu a dịka Sunday Times siri chopụta. Ha na-ana ihe ruru dọla puku atọ maka awamahụ na-ewe otu awa. Ndị na-ekwu maka mmegbu umụnwaanyị na-akọwa na ụlọọgwụ a na-akpata ego n'aka ụmụnwaanyi ofufe alakụba na-atụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ya bụru na di ha chopụtara na ha adịghị ""nzo"" n'abalị ọlụlụ ha. Na intanetị, ndị na-awa ụdịrị ahụ - dịka Gynae Ceentre nke London - a na-ede na-akwa umụnwaanyị na abị ebe ahụ na ""enwere alụmdi na nwunye gbasara"" dịka nwoke chopụtara na ibe otu ha agbapera. Gynae Centre asaghị ajụjụ BBC maka okwu a. 'Ezigbote ajo ihe' Onye na-ahụ ahuike na mba Briten bụ Matt Hancock si na ya na-eme nyocha etu a ga-esi kwụsị ""ajọ ihe a"" mana ngalaba na-ahu maka ahụike ekweghi ikwu etu a ga-esi hụ na mmachi ihe di ire. Mana Nwa ada Taheri sị: ""Ụmụagbọghọ ga-anwụ ma ya bụrụ na mmachi ihe a esoghi ezigbote usoro."" Dr Khalid Khan, bu ọkammụta Ahụike Ụmụnwaayị na mahadum ahụike nke London hụ ebe emere ihe a ma sị mmachi abụghị etu ekwesiri iji so ya bu ihe. E nweela ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arụgharị ọtụ ha Ụdịrị awamahụ ọtụ, dịka nke akpọrọ ""labiaplasty"", bụ nke a na-eme site ibe ọnụ ọtụ ka opee mpe na-ewu na Briten. Ụmụnwaanyị ọ na-ewuru si agbụru di iche iche. Nwa ada Taheri sị: ""Ụmụnwaanyi a na-ahụ onwe ha ka ihe ụmụnwoke na-achọ maka ndina. Ha anaghi ahu onwe ha ka mmadụ. ""Umụnwaanyi ofufe Alakuba na-eme ihe maka ha na-atụ ụjọ na-aga ata ha ahụhụ ma na-eme ihere. ""Ndị ọzọ na-eme eme ya maka ha ahụghị etu ha dị n'anya maka ihe ụwa na-agwa ha dị mma.""" afirika-44050332,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44050332,Uru ise dị na mgbanwe ego Nigeria na China mere,"Ndị ọkacharamara na-akọwa mkpa ọ dị ka Naijiria ike nkwụcha n'atụmatụ mgbanwe ego anyị na China mere na nsonso ìji nweta uru dị ya, ma gbalahụ ọghọm.","Naijiria na China nwere nkwekọrịta mgbanwe ego ọnụahịa ya pụtara ijeri naira 844 nke pụtara ijeri Yuan 15 Naijiria na China nwere nkwekọrịta mgbanwe ego ọnụahịa ya pụtara ijeri naira 844 pụtara ijeri Yuan 15 maọbụ $2.36. Uche Uwalaeke bụ ọkammụta n'ihe gbasara ego na Nassarawa State University na Ken Ụkaọha bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ahịa na Naijiria kwenyere na nkwekọrịta a Naijiria na China mere ga akwalite akụnaụba ala anyị. Mana ha dọrọ gọọmenti aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụ na Chịna bịara rụọ ụlọọrụ mmepụta ngwahịa ha na Naijiria iji nye ohere ka ndị ala anyị mụta nka imepụta ihe ndị a n'onwe ha. Lee ole na ole na uru na ọghọm dị ya: URU DỊ NA YA 1. Ọ ga-enyere azụmahịa aka Ha kwuru na ọ ga-enyere ndị na-atụbata ihe aka inweta mgbanwe ego iji zụta ahịa na China na-enweghị mkpa ị ga nwe ego na dọla nke na-arịa ahụ ugbua. Uwaleke kwuru, ""China bụ otu mba kachasị na ndị ha na Naijiria na-azụkọ ahịa. Ọ ga-eme ka azụmahịa gaa ọfụma."" 2. Ọ ga-enye aka ka ọnụ ego Naira na ebe dọla dị gbalite Ndị ọkacharamara na-ekwu na ọ ga-ebelata oke ịchụgharị dọla. Uwaleke sị ""Ọ ga-eme ka foreiegbn exchange gbalite, ka ọnụego mgbanwe ego(exchange rate) gbalite"". Uwaleke kwukwara na ọ ga-eme ka naira sikwa ike n'ihi na ndị Naijiria ""na-achọ dọla ga-ebelata. Ọke ọnụ ahịa ga-ebelatakwa"" 3. Ndị mba iwepeta ego n'ala Naijiria Ukaọha gara n'ihu kọwa na ọ ga-eme ka ndị ojiegoachụego ndị China bịa na Naijiria tinye ego na akụnaụba ala anyị 4. Naijiria ga-ebitenwu ego n'ọnụ ala na China Naijiria na ndị ojiegoachụego ga na enweta ohere ibite ego n'ọnụala na China. 5. Naijiria ga-na enweta ego site na ịna ụtụ Ukaoha kwuru na gọọmentị ga na-enweta ego site na ịna ụtụ na ngwaahịa e si China atụbata OGHOM DI NA YA Mana ọ bụrụ na gọọmentị akpachapụghị anya na ịhazị atụmatụ ahụ nke ga-adị afọ atọ, ọghọm nwere ike imebi ihe ga-aba ya. 1. Oke mbubata ngwaahịa China Uwaleke kwuru ga-eme ka ngwaahịa si China kalia na Naijiria nke nwere ike imemina ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa nke ndị Naijiria. Ọ dụrụ ọdụ ka ""Gọọmentị nwere ike tinye ego n'ụtụ a na-ana n'ahịa e si China bubata, iji belata nke a"". N'otu aka ahụ Ụkaọha kwuru na ọ dị mkpa ka Naijiria kwube okwu ihe anyị ga-na-emepụta aga na-ezipụ China ka ọ ghara ị bụ sọsọ ha na-ebujuu ngwahịa ha n'alka anyị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45925850,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45925850,NHIS: Gịnị mere Buhari ji ekpuchi Usman Yusuf?-PDP,"N'etufughị oge, otu PDP akpokuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ kọwara ụmụ Naịjirịa ihe kpatara o ji ekpuchi odee akwụkwọ ụlọọrụ NHIS bụ ọkachamara Usman Yakubu,","Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa kwuru onye ha kwuru na-ebola ọtụtụ ebubo nrụrụaka nakwa ego a sị ozuru ruru ijeri naira iri abụọ na ise. Ha depụtara nke a n'akara twitter ha: End of Twitter post, 1 Ndị uweojii ruru iri ise wakporo isi ụlọọrụ ndị National Health Insurance Scheme dịka ha dulatara onye odeakwụkwọ ha bụ Professor Usman Yusuf akwụsịrị ọrụ n'ime ụlọọrụ. Ndị ntaakụkọ nọ mgbe ihe a mere kwuru na ndị uweojii gbara ndị ụlọọrụ NHIS anwụrụ anya mmiri ka ha ghara i gbochi ndụbata Yusuf. Yusuf kwuru na ndị isi NHIS enweghi ikike ịkwụsị ya ọrụ. Cheta na ndị isi ụlọọrụ NHIS kwụsịrị Yusuf ọrụ ruo oge a na-amaghị n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Oktoba. Ndị ụlọọrụ NHIS kwadoro ọrụ akwụsiri Yusuf Onyeisi ọgbakọ a kpebiri ị kwụsị Yusuf ọrụ bụ Yantu Ifene kwuru na ọ bụ maka nrụrụaka ego ruru nde narị naịra iri na itoolu. Ka akwụsi chara ya ọrụ, onye odee akwukwọ a ṅụrụ iyi na ọ gaghị akwụsị ọrụ dịka ndị ọgbakọ sịrị kpebi e, na-ekwukwa na ọ bụ naanị onyeisiala nwereike iwepụ ya n'oche. Ihe ọzọ ndị mmadụ na-ekwu maka akụkọ a n'elu soshal midia: @iykkman kwuru na ihe a abụghị mbụ Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45550235,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45550235,Fayose asaala EFCC: Egwu ihe ga-eme echi anaghị atụ m,Gọvanọ Ekiti steeti bụ Ayo Fayose ekwuola na EFCC itinye aha ya n'akwụkwọ ndị a na-achọ achọ bụ agwa ụmụaka.,"Ayo Fayose ga-aritu n'ọkwa Gọvanọr n' abalị 15 nke ọnwa OỌktoba afọ 2018 EFCC degara ụlọọrụ gọọmenti na-echekwa agbata Naịjirịa na mba ndị ọzọ nke a kpọrọ 'Nigeria Custom Service' (NCS) akwụkwọ ka ha gbochie aka na-achị Ekiti steeti bụ Fayose ịgafe mba ọzọ site n'elu, ala maọbụ oke osimmiri. N'akwụkwọ ozi onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu degara Kọstọm n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Septemba, o kwuru na a na-enyocha Fayose nakwa na a na-atụ uche na o nwere ike ịgbapụ n'ala Naịjirịa iji gbalahụ nyocha. Kọstọm nabatara ozi ahụ ma gbasaa ya n'ụlọọrụ ha niile dị na mpaghara dị iche iche, wee gwa ha ka ha mụrụ anya dịka azụ n'inyo nwa amadị ahụ ma wetara EFCC ozi ma ọ bụrụ na anya ha hụ Fayose. Cheta na n'izu gara aga, Fayose degachara ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka akwụkwọ ozi, gwa ha na ya ga-awụchi n'ụlọọrụ ha n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọktoba. Abalị iri na ise nke ọnwa Ọktoba bụ ụbọchị Fayose ga-aritu n'ọkwa dịka gọvanọ. Ka ọ dị ugbua, Fayose asaala EFCC si na ha itinye aha ya n'akwụkwọ ndị a na-achọ achọ abụghị naanị ndorondoro ọchịchị kama ọ bụ agwa ụmụaka. Fayose kwuru n'akara Twitter ya sị, ""Egwu anaghị atụ m maka ihe ga-eme echi. O nweghi onye bụ Chukwu. Ha tuwa anya m n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọktoba, 2018."" ""Aga m anọgide na otu PDP na agbanyeghị mmaja ha niile."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45179631,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45179631,Ndị kpuru isi n'Imo steeti na-egosi iwe ha na ha enweghi ọrụ,Ọtụtụ ndị kpuru isi n'Imo steeti wuchiri ụlọ gọọmenti ha n'Owere wee gbochie ụzọ na-aba ya iji gosi iwe ha n'etu e si emekpa ha ahụ.,"Ndị isi ahụ n'okpuru otu ha kpọrọ Nigerian Association of the Blind (NAB) na Bekee boro gọọmenti Rochas Okorocha ebubo na ha na-akpaso ha agwa ka ha abụ ndị ọbịa n'ala nke ha. Ha bere nwịị na gọọmenti ahụ ugboro ugboro achọghị ige ha ntị maọbụ leba anya n'ihe ha na-agabiga. Dịka akwụkwọ mgbasaozi Vanguard siri dee, onyeisi otu NAB nke Imo steeti bụ Christopher Kalu kwuru na ụdị omume gọọmenti na-emeso ha na-agbawa ha obi ma na-ewuta ha nke ukwuu maka na ọtụtụ nsogbu ha buru bịakwute ya ụfọdụ afọ gara aga enweghi ihe e mere maka ya. Agbanyeghi ọrụ ndị isi ahụ na-achọ, ha chọkwara ka gọọmenti wepụtara ha ego gbata gbata kwesiri iru ndị isi ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ nke ruorola afọ asaa. N'okwu ya; Kalu kwuru ""Anyị na-achọ ego ruru nde naịra 4.5 nakwa ka e nye ndị otu anyị gụchara mahadum ọrụ na steeti. Anyị achọghị ihe karịrị akarị."" Akụkọ na-ekwu na a kpọrọ Kalu ka ya na gọvanọ nwee ọgbakọ n'ime ụlọ gọọmenti, oge ọ pụtara, ọ gwara ndị otu ya na obi dị ya ụtọ n'ihe ya na gọọmenti kpara. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43608307,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43608307,Anyị ga-anakọsị mmadụ egbe niile - Komịshịọna uweojii,"Iji rube isi na iwu inspector General nke ndị uwe ojii na Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere, ndị uweojii n'Enugwu steeti ekpokotala egbe dị 148.","Kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed ekwuola na ndị uweojii na-ebuso ndị na-enupu isi n'iwu ọgwụ na steeti ahụ Onye kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe nile ndị ahụ, nke okwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee Chekwa ndụ na akụ na ụba. Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gunyere; Ak 47 10, Egbe pump action 13, obere egbe nwere otu barrel 33, obere egbe nwere ọnụ abụọ 36, Egbe obere nwere ọnụ asatọ, revolver atọ, obere egbe Barrera 11, ogologo egbe otu barrel 18, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụ ọgụgụ. Ụkọ ọrụ na-ebute nnupu isi n'iwu Kọmishịọna Danmallam kwuru na ihea bụ mmeri ha nwetara na-agba nke mbụ ha jiri bido ya bụ ịnapụ ndị mmadụ egbe dịka onye isi ha kpata kpata siri nye ha iwu. Otoro ọrụ gbanụ gbanụ nke ACP Frank Idu nọ n'isi ya ma gwa ha ka ha were ngwa ngwa nakọtasịa egbe nine ndị mmadụ ji. Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha jiri aka ha were egbe ha nwere n'ulo ha nyefee ndị uweojii ghara iche ka ewere aka ike bịa nara ha ya. Ya bụ ọrụ gbanụ a ka ndị uwe ojii n'Enugwu kwuru na ọga adị ire ruo mgbe ha nakọsịtachara ndị mmadu nkịtị egbe ha ji. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51536116,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51536116,Chelsea vs Man United: E reela Chelsea ka ọkpa 9th Mile rie 'change',Na Chelsea nyere goolu abụọ a gụfuru agufu azọnwughi ha n'aka ndị Manchester United riri ha ka ọkpa dị ọkụ n'ụlọ ha.,"Goolu abụọ Anthony Martial nyere na nkeji 45 na nke Harry Maguire nyere na nkeji 66 zuru ịgba ha n'akpa ma nye Man Utd mmeri ha chọ bịa Stamford Bridge. Bido n'isi egwuregwu a ka ndị Man Utd zọwara Chelsea Ojukwu, ọkachasị mgbe e wepụrụ N'golo Kante mere ka ọ na-achaturu ha ọkụ na nkeji iri e ji bido bọọlụ. E ji mkpebi ihe onyonyo VAR gụfuo goolu abụọ ndị Chelsea gbakanyere, nke mere ka obi daa ndị na-akawado ha ka ebe a wụrụ mmadụ mmiri ọkụ. E bu ụzọ gụfuo goolu Kourt Zouma dịka VAR gosiri na aka Caesar Azpilicueta kwara Brandon Willliams enyeghị ya ohere ịgbafu bọolụ dịka onye egwu azụ. Ebe a gụfuru nke Olivier Giroud na nkeji 76 dịka VAR gosiri na ụkwụ ya gafere ebe ọ na-ekwesịghị. Ndị mmadụ na-eti mkpu na e kwesịrị ịchụpụ Maguire dịka ọ zọrọ Michy Batshuayi ụkwụ n'amụ, mana VAR nyochara ya sị na e nweghi ihe ọjọo mere. Odion Ighalo bụ onye ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka Chelsea nabatara Manchester United na Stamford Bridge. Ndị Naịjirịa kere ajị n'ume na-eche ịma ma nwanna ha ọ ga-aza aha nna ya. Mgbe e wepụrụ Martial webata ya na nkeji 90, ọ nwara ike ya ịgbakanye goolu, mana isi ya apụtaghị. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị 41 nọrọ n'ọkwa anọ na tebulu Premier League ebe Man Utd ji pọịntị 38 si n'ọkwa itoolu rigoro asaa. N'egwuregwu ikpeazụ ha gbara tupu nke a, Chelsea na Leicester City ji goolu abụọ abụọ dọọ ka ọkwụrụ, ebe Man Utd na onwe ha gba aka goolu mgbe ha gbara ọnyụpa ka ha na Wolves zutere. Gịnị gbasara Ighalo? Ighalo bụ onye Naịjiria mbụ ga-agbara Manchester United kemgbe ha kpọrọla ya na mbinye ebe ọ ga-anọ ọnwa isii, so na ndị a kpọpụtara nwereike iso agbaso Chelsea bọọlụ. Dịka Ole Gunna Solskjaer bụ onye nchịkọta Man Utd na-atụ anya na Ighalo na Bruno Fernandes ha zụrụ ọhụrụ ga-etikọta isi ọnụ gwọọ Chelsea ara. N'ụbọchị nke 16 nke ọnwa Febrụwarị a, chi fotere ụbọchị asọmpi Man Utd na Chelsea, ka Ole kwuru na Ighalo nwereike ịnọrọzị n'otu ya ma ọ bụrụ na ihe jikọrọ ya na Shanghai Shenhua bie n'afọ a. Mana kedụ ihe ị che? Odion ọ ga-agbatanwu ihe Man Utd ga-eji kwụzịa ụgwọ isi ya?" afirika-52708243,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52708243,Recession: Gịnị ka ọ pụtara?,"Naịjirịa abanyela ọtanisi ọzọ dịka ụlọrụ National Bureau of Statistics (NBS) si kwupụta ụnyahụ bụ Novemba 21,2020.","Nke a ga-eme ugboro abụọ Naịjirịa na-abanye ọtanisi dịka onyeisiala Buhari chịrịla ruo afọ ise. Ọtanisi mbụ okpuruọchịchị ya ugbua mere n'afọ 2016. Ihe recession pụtara Ndalata Akụ maọbụ ""Recession"" n'okwu bekee bụ ihe ọtụtụ mba achọghị iji ntị ha nụ na ọ na-eme na mba ha. N'oge coronavirus a, ụfọdụ mba ndị gunyere Jamanị, Fransị na Italị abanyela ya bụ oge ndalata akụ. Ụfọdụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo kwuburu na n'oge na adịghi anya na Naijirịa nwere ịke ịdabanye na ndalata akụ. Oge ndalata akụ na-abụkarị oge ihe isi ike nye mmadụ niile. Dịka ị nwere ike ibido ị nụ akụkọ maka ndalata akụ a maọbụ ""Recession"" n'ihe mgbasa ozi dị iche iche, ka anyi kọwara gị ihe bụ ndalata akụ a. Iji nweta elele dị n'akụkọ a, BBCIgbo kpọrọ ndị ọnụ na-erute n'okwu maka ihe gbasara akụnụba obodo bụ Anthony Agbo na Okechukwu Okere. Gini bụ Ndalata Akụ (Recession) Mazị Anthony Agbo kọwara Ndalata Akụ dịka oge akụnụba mba na-agbada agbada. E ji ya atule etu achụmta ego si a ga na mba. Mazị Okechukwu Okere kọwara na ọ na-abụ ọnwa atọ gara n'usoro ka a na-atule ma ụba mba ọbanyela ndalata akụ. Ọnwa ndị a na-abụkarị ọnwa Machị, Jun,Sepụtemba na Dịsemba. Ọ bụrụ na achụmta ego na ụba obodo na-agbada site na ọnwa atọ banye ọnwa atọ ndị a, ị mara na mba ahụ abanyela ndalata akụ. Ụfọdụ ihe na egosipụta Ndalata Akụ bụ : Ihe ndị a gafee ọnwa atọ na-esọ ibe ya n'azụ nke bekee kpọrọ 'quaterly' ị mara na mba ahụ abanyela ọnọdụ ndalata akụ. Naijirịa ọ nọ na ndalata akụ ka anyị a ga-adanye nsonso a Agbo kwuru na n'uche nke ya, na Naijirịa abanyela oge ndalata akụ dịka ihe niile na-egosi na mba abanyela ọnọdụ a na-egosi. N'aka nke ọzọ ka Okere na-akọwa na ọ bụ mgbe Naijirịa nọrọ ọnọdụ a n'ime ọnwa isii ka e nere ike ị sị na ọbanyela ndalata akụ. Kama Okere kwuru na n'ụche obi ya na Naijirịa nwere ike ịdanye na ndalata akụ n'ihi na ego mmanụ agbidi agbdaala na mba ụwa maka ọrịa coronavirus. O kwuru sị "" Etu gọọmentị si enyere akụnụba mba aka bụ iru ihe dị cihe cihe dịka ụzọ na ihe ndị ọzọ nke na-eme ka ego bata n'aka ndị mmadụ mana ọ bụrụ na ha ereteghị ego site na mmanụ agbidi, ọ ga-esi ike ike nke a"". Kedụ etu mmadụ ga-esi kwado maka ya. Agbo na Okere kwuru na ọ dị mkpa ka mmadụ niile wetulata aka etu ha si emefu ego Agbọ kọwara na ụfọdụ ihe mmadụ ga-eme iji gbanahụ ịda ụbịam oge ndalata akụ gụnyere Okere kwuru na ị sị ndị mmadụ jichie ego ha ga-eme ka ndalata akụ dakwasị Naijirịa kama ọ kwuru dịka Agbo si kwuo ka mmadụ niile wetulata aka n'ego ha na-emefu. Gọọmentị e nwere ihe ha kwesiri ime? Okere kọwara na gọọmentị kwesiri ibido ugbua tinye aka ịkwalite akụkụ akụnụba Naijirịa ndị ọzọ n'ihi na mmanụagbidi enwereike ọgaghị azọ anyị. Naijirịa megharịrị ụsoro mmefụ ego dịka ego mmanụ agbidi gbadara Ọ mara atụ sị "" gọọmentị mepee njem na imepụta ọkụ Latrịk ka ndị ụlọọrụ nọrọ onwe banye na ya ga-eme ka ụlọọrụ ndị a nye ndị mmadụ ọrụ ma mee ka akụnụba Naijirịa gbalite"". Okere kwukwara na gọọmentị nwere ike ibite ego iji nyere ụlọọrụ dị iche iche aka iji kwalite akụnụba Naijirịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-55556725,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55556725,Electoral College Certification: Mike Pence na ndị omeiwu Amerịka ha enwere ike ịkụchapụ mmeri Joe Biden?,"Njem Joe Biden ịbụ onyeisiala Amerịka ga-eru n'isi mmiri taa bụ Wenezde, abalị isii nke ọnwa Jenụwarị 2021 dịka ndị Omeiwu Amerịka ga-ezute ma mepee akwụkwọ mpụtara ntuliaka e mere n'afọ 2020 si steeti dị iche iche.","Joe Biden meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Amerịka, mana Onyeisiala Donald Trump ekwetabeghị. Na mbụ, imepe vootu ndị a anaghị abụ ihe na-agbagwoju anya mana ugbua, Donald Trump ka na-ekwusi ike na ọ bụ ya meriri ntuliaka onye ga-achị mba Amerịka site afọ 2021 ruo 2024. Ọ na-ekwu nke a n'agbanyeghị na Joe Biden bụ onye zọrọ ọchịchị pati Demokrat ji ihe ruru vootu nde asatọ gafee nke ya. Biden nwetekwara vootu 306 a na-akpọ ""Electoral College Votes"" na Bekee ebe Trump nwetere 232. Vootu Electoral College ahụ bụ ihe ndị Omeiwu Amerịka ga-ebinye aka na ya n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị 2021. Mkpebi Trump a mere ka ụfọdụ ndị omeiwu si pati Repọblịkan na-akpọ ka akagbuo mpụtara ntuliaka steeti ụfọdụ. Etu njem mbinye aka a ga-esi ga Daddy Hezekiah: E meghi m ihe m meere Donald Trump maka ""Visa"" N'elekere mbụ nke ehihie, ndị omeiwu niile ga-ezukọ n'Ụlọ Omeiwu ebe Osote Onyeisiala Mike Pence ga-anọ n'isi oche dịka ọ bụ ya bụ onyeisi ndị Omeiwu Amerịka. A ga-ebubata akpatị abuọ mpụtara ntuliaka si steeti dị iche iche, Pence ga-emepe ya wee nye ndị ahọpụtara ga-agụpụta ha. Ọ gwụchaala nke a bụ ihe Pence nwere ịrụ, mana Trump tụrụ asị na o nwere ikike ịgbajọ ntuliaka ụfọdụ. Nke a abụghị eziokwu, dịka iwu Amerịka si dị: Ihe dị iche ọ ga-eme? Dịka e si eme ya mbụ, ibinye aka na vootu a abụghị ihe na-agafe otu awa, mana a na-ele anya na nke afọ nwereike gafee otu ụbọchị dịka ndị omeiwu Repọblịkan na-eme mgbajọ mpụtara ụfọdụ steeti. Ndi omeiwu gaa n'ihu mee ihe ha sị na ha ga-eme ndi omeiwu nta ga-abanye ụlọ omeiwu ha ga tụọ vootu nke a ga-eji mara ma a ga-aga n'ihu binye aka maọbụ gee ihe ha na-ekwu nti. Ndi omeiwu ukwu ga-agakwa ụlọ omeiwu ha mekwaa etu a. Usoro eji agbajọ mpụtara ntuliaka kwuru na onye omeiwu nta chọrọ ime otu a ga-enweriri onye omeiwu ukwu ga-akwado ya. Ka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu nta 140 na ndị nke ukwu 12 sị na ha ga-agbajọ mpụtara ntuliaka n'ihe ruru steeti 6. E nwere ndị Repọblịkan anabataghị atụmatụ ịgbajọ mpụtara ntuliaka a. Oneyisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu bụ Mitch McConnell arịọla ndị patị ya ka ha ghara ime ihe a ha chọrọ ime. Mitch McConnell bụ onyeisi ụlọ omeiwu ukwu nke mba Amerịka Ebumnobi McConnell nwere ike bụrụ makana ọ ma na atụmatụ ahụ agaghị agbanwe ihe ọbụla. Emechakwaa ihe niile, Joe Biden ka ga-abụ onyeisiala. Ndị omeiwu ukwu na nke nta ga-eme nrụrịtaụka tupu ha atụọ vootu. Dịka ndị Demokrat ka n'ụlọ omeiwu nta, a na-eche na ha ga-asị ka a gaa n'ihu. E meela ụdịrị ihe a mbụ? N'afọ 2005, ndị patị Demokrat abụọ - Stephanie Tubbs Jones na Sinetọ Barbara Boxer - gbajọrọ mpụtara vootu steeti Ohio, maka ha sị na nrụrụaka dị na ya. Ụlọọmeiwu nta na nke ukwu anabataghị atụmatụ ha. Ha gara n'ihu binye aka na mpụtara ntuliaka ahụ. N'afọ 2017, n'oge Joe Biden nọ n'isi dịka Osote Onyeisiala, ụfọdụ ndị omeiwu Demokrat pụtara ịsị na ha anabataghị mpụtara ntuliaka aha mana Biden kwụsịrị ha wee sị: ""okwu agwụla""." afirika-44312695,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44312695,EFCC anwụchiela aka chịbụrụ Kaduna Steeti,"Aka chịburu Kadụna steeti bụ Ramalan Yero, so na ndị EFCC nwụchikọrọ na Kaduna ụnyaahụ ma kpọsa ha na nga ka ha zara oku iza ọnụ ha banyere etu aka ha siri dị na mmerụaka ego PDP jiri me ndọrọndọrọ nke 2015.","Ibrahim Magu na ndị ọrụ ya na-ekwu na ha na arụsi ọrụ ike, mana ndị mmadụ na-ekwu na ha na-ahọ ndị ha na-anwụchikọ Ndị ọzọ anwụchikọrọ bụ onye bụbụ onyeisi pati anọghi n'ọchịchị ugbua bụ nke akpọrọ Peoples Democratic Party (PDP) nke Kaduna bụ Abubakar Gaya- Haruna; Onye bụbụ ode akwụkwọ Kaduna steeti bụ Hamza Ishaq, nakwa onye bụbụ Minista Nuhu Somo Way. Maazị Yero bụbụ onye ndị EFCC na-nyocha maka ebubo na aka ya dị na nkekọrịta nde 750 PDP jịri eme ndọrọndọrọ ntụlịaka 2015. Yero na mmadụ atọ a zara azịza n'ime izuụka gara aga, ma binyekwa aka n'ime ụfọdụ akwụkọ mmetụtara ndị a na-enyocha enyocha mana a hapụrụ ha ka ha laa be ha. Mana, ka ha gara ụlọ ndị EFCC dị na Kaduna, ekweghi ka ha la makana ha ga-aga ụlọikpe ịzara ọnu ha tata. Yero na ndi ọzọ ahu nọbụ na-aga ụlọorọ ndị EFCC ahụ kamgbe n'ọnwa ole na ole gara aga. Onye EFCC kwuru na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe taa. Cheta na ụnyaahụ ndị EFCC wetara mmeri n'ikpe nke onye na-achịbụ Taraba steetị bụ Jolly Nyame maka nrụrụ aka omere. Maazị Nyame ga-anọ na mkpọrọ afọ 14. Ikpe a mara Nyame nwereike inyere ndị pati na-achị aka maka ime ka ndị mmadụ hapụ ị na-ekwu na ha adịghị enweta mmeri ọbụla ma agha ha na-ebuso mpụ na awụwọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55276059,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55276059,Lee ihe ikwesiri ịma maka ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo,"Igbo sị na ""Eze pụọ Eze anọchie"" etu a ka ọ dị n'ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo ka ha na-akwado ịhọpụta onyeisi ọhụrụ.","Ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ ọkwa oge ya bụ afọ anọ n'ime otu ọnụ ọchịchị. Onye ọbụla meriri ntuliaka a ga-abụ onyeisi Ohanaeze nke ugboro iri ga-edu ha ruo afọ anọ ọzọ. Kedụ ndị na-azọ ọkwa a? Ndị okenye ise ndị nwere agba n'Imo Steetị nakwa ala Igbo niile ga-achịpụ ya n'ịzọ ọkwa onyeisi Ohanaeze nke afọ a. Lee ha: 1: Chidi Osuagwu Ọ bụ nwafọ Imo Steetị . Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Indiana (1975), mahadum Youngstown State (1978), mahadum Texas (1978 ruo 1979), mahadum Pọtakọt (1993). O nwetere ọzụzụ na ngalaba Biochemistry, Chemistry, Medical Chemistry `. Ọ na-akuzi na mahadum FUTO dị n'Owere, Imo Steettị, ọ kụziela n'ọtụtụ mahadum kamgbe afọ 1978. Ọ bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo nke Imo Steetị site n'afọ 2007 ruo 2009. 2: Chris Asoluka Chris Asoluka bụ nwafọ Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị n'Ibadan nakwa Mahadum Lọndọn na ngalaba ndọrọ ọchịchị na ọkaiwu. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye omeiwu nta n'afọ 1992 ruo 1993. Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ego na mmepe akụnaụba n'Imo Steetị site n'afọ 1994 ruo 1996. Ọ ji ọkwa onyeisi ụlọọrụ ""Onne oil and Gas Free Zone Authority"" kamgbe afọ 2013 rute ugbua. 3: Goddy Uwazuruike Goddy Uwazuruike bụbụ onyeisi otu Aka-Ikenga Goddy Uwazuruike bụ nwafọ Mbano dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na 'Immaculate Conception Seminary Ahiaeke Umuahia' afọ 1971 ruo 1975. Gụọ mahadum na mahadum Imo Steetị ma banyezie mahadum Naịjirịa dị n'Enugwu ebe o nwetere ọzụzụ dịka ọkaiwu site na 1985 ruo 1988. Ọ bụ onyeisi ọkaiwu n'ụlọọrụ mkpechite ọnụ bụ Uwazuruike and Associates. Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe dị iche iche nke gụnyere SKARPUT Nig Ltd, Kaygee Communications, Multitrust Services dgz. Uwazuruike ji ọkwa odeakụkwọ ukwu Aka-Ikenga site n'afọ 2002. 4: Joe Nwaorgu Joe Nwaorgu bụ nwafọ Ngor Okpala dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa na mahadum Cambridge dị na Lọndọn ebe o nwere ọzụzụ 'Estate Management'. Ọ kụziri nkuzi na mahadum Naịjirịa afọ iri site na 1974 ruo 1984. Ọ rụrụ ọrụ bekee n'ụlọọrụ gọọmentị etiti ruo afọ 1988 ọ lara ezumike nka. Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Joe Nwaorgu and Associates, Estate Surveyors and Valuers' n'afọ 1994 ruo 1996. Ọ rụrụ ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, ụlọ na njem ụgbọala nke Imo Steetị, nye aka na nrụchapụ ọdọụgbọelu Imo Steetị n'afọ 1994. Nwaorgu ejiela ọkwa osote odeakwụkwọ ukwu Ohanaeze Ndigbo n'afọ 2000 ruo 2004 ma bụrụ odeakwụkwọ ukwu ha n'afọ 2003 ruo 2017. 5: George Obiozor George Obiozor bụ nwafọ Awo-Omamma dị n'Imo Steetị. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma Comprehensive n'afọ 1959 ruo 1963. Gụọ akwụkwọ dị elu na 'Institute of African Studies Switzerland (1967), mahadum South Tacoma USA (1967), mahadum Columbia (1968). Ọ nwere ọzụzụ na ngalaba dịka ọkaiwu mbaụwa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya. Ọ kuziri nkuzi n'ụlọakwụkwọ Awo-Omamma, Mahadum Columbia. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye na-anọchịteanya Naịjirịa na mba dịka Amerịka (2004 ruo 2008), Izrel (1999 ruo 2003), Cyprus. Ma rụọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Institute of International Affairs'. O dere akwụkwọ di iche iche banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mba na ibe ya." afirika-49868995,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49868995,Aisha Buhari: Kedụ ebe Agụ nwaanyị a nọ ugbua?,Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ọ bụghị mbọ mbọ ọsọ ka nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari riri n'Aso Rock kamgbe ọnwa abụọ.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ọnụ na-ekwuru Aisha Buhari bụ Suleiman Haruna gọrọ na ọ bụghị mgbapụ maka ihe ndị mmadụ kpọrọ 'atụmaatụ ọjọ' dị n'ọchịchị di ya bụ Buhari ka o mere. Akụkọ na-ewu ewu na-ekwu na o teela ahụrụ Aisha na di ya mgbe ha gakọrọ emume nakwa na o si Saudi Arabia gawa London dịka e mechara emume okwukwe Hajj. Haruna kwuru na nwunye onyesisiala nwere ikike ị ga njem n'ebe ọbụla sọrọ ya dịka nwafọ Naịjịrịa a na-ekeghị agbụ. Ọ gwara ndị ntaakụkọ ụlọọrụ mgbasa ozi Punch na ọ bụ eziokwu na Aisha Buhari anọghị na Naịjirịa ugbua mana ọ bụghị maka esemokwu ọbụla. Mgbe ndị ụlọọrụ ahụ jụrụ Haruna maka kepu kepu a na-anụ maka etu agwa ndị gbara dị ya okiri okiri si ewute ya mere o ji gbafuo. Haruna kwuru na ya bụ akụkọ na-agbagwọjụ ya anya makana ọ maghị ebe o si. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @OlayinkaLere na-ajụ ebe nwunye onyeisiala nọ? @NekkaSmith kwuru na ọ bụ makana nwunye onyeisiala anaghị arụsị ọrụ ya ike kpatara eji gba ya nkịtị, @Tutsy22 na-ajụsi ike ebe Aisha nọ? Ụfọdụihe ndị Aisha katọgoro maka ọchịchị di ya bụ Buhari Ihe nkiri a ga-amasị gị Uche Ntoroọbịa: Kedụ mgbe ị ga-eme nsusu ọnụ? Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49460159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49460159,Flooding in Nigeria: 'Idemmiri na-achọ iburu ụlọ anyị',Ọ bụghịzị ihe akụkọ na idemmiri nke afọ a amalitela ịkpa ike n'uju n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa.,"Idemmiri na-achọ ịchụpụ ndị mmadụ n'ụlọ n'Enugu N'ime izuụka a nke ruturu ụfọdụ mpaghara ọwụwaanyanwụ dị iche iche nke otu n'ime ha bụ Enugwu Steeti. Oke mmiri na-ezo n'Enugwu kamgbe ụbọ ole na ole gara aga abụrụla ọdachi dịrị ndị bị n'Eke Obinagu Emene n'ihi na ide mmiri ekweghị ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ndị bị n'obodo a kwuru na ihe ha chere butere ya enweghi ezigbo ntọala ọwara ebe mmiri si agafe. Nke mere na mgbe ọbụla mmiri zoro, ide mmiri na-abata n'ime ụlọ ha na emebisiri ha ngwongwo ụlọ. Otu nwoke bụ Onyeka Onochie ọrụ ya bụ ịkpụ blọọkụ kwara arịrị na idemmiri dọrọ n'ebe ọ na-akpụ blọọkụ emebichaala ndị ọ kpụrụ akpụ. O kwuru na nke a metụtara ya nke ukwuu n'ihi na o nweteghi ego o ji a kpụ ọzọ. Onye ọzọ bụ Chinedu na-azụkwa ahịa n'Eke Obinagu gwara BBC Igbo na kamgbe idemmiri a dọchiri ihu ụlọ ahịa ya onweghịzị onye na-azụ ya ihe. Ndị ọzọ kwuru na idemmiri na-emebisi ihe ha kwa afọ ma rịọ gọọmentị ka a gbatara ndị Eke Obinagu Enugwu ọsọ enyemaka. Cheta na ụlọọrụ gbatagbata na Naịjirịa bụ NEMA n'ịchafụ dị na mbụ dọọ ndị mmadụ aka na nti maka idemmiri nke afọ a. Ihe nkiri ga-amasị gị: Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." afirika-51186869,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186869,Coronavirus: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus,Ọrịa Coronavirus bụ ọrịa na-efe efe si n'ikuru ume na-egbu mmadụ. A chọpụtara ya n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna.,"Gịnị bụ coronavirus? Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ. A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya. Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ. Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite. Olee mba ndị coronavirus metụtara? Kedụ ihe eji amata Coronavirus Ọ na-ebidokarị dịka ahụọkụ na ọkwara ike. O ruo otu izuụka, ọ bido ume obibi (onye ahụ agaghịzị eku ume nke ọma), mgbe ahụ onye ahụ nwere ike ịnọ n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ. Ọ na-egosịkwa dịka ahụụfụ na ike ọgwụgwụ. Mana onwere ike ịnọrụ izuụka abụọ n'ahụ mmadụ tupu ihe ndị a egosiwa. O nwere mgbochi? Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya. Kedụ ebe a kwụ akwụ ugbua? A ka na-enyocha ihe si n'ahụ ndị na-arịa ọrịa a na laabụ, ịchọpụta ihe kpatara ya na etu e si agwọ ya. Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị: Onye meriri ọrịa kansa" afirika-45699869,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45699869,PDP Primaries: Ikpeazu ga-anọchite anya ha na ntuliaka 2019,Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-ekwu na ahọpụtara Okezie Ikpeazu dịka onye ga-anọchite anya ndị PDP na ndọrọndọrọ ọchịchị 2019.,"Ndị PDP chọrọ ka Ikpeazu nọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị gọvanọ Abịa steeti Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe a gụkọrọ akwụkwọ e ji mee ya bụ ntuliaka imeụlọ, kwuru na Ikpeazu nwetara vootu 1991 n'ime 2207 a tụkọtara. Dịka o si gaa, a gụkọrọ akwụkwọ vootu ole a tụtara na ntuliaka imeụlọ ndị PDP Abịa steeti n'ọgbọ egwuregwu 'Umuahia Township stadium' ebe a nọ mee ya bụ ntuliaka. A na-agbakọ ọnụọgụgụ ndị tunyere akwụkwọ ntuliaka Ndị PDP nke Abịa steeti ji obiọma ha niile mee ntuliaka imeụlọ maka ịhọpụta ndị ga-eso zọọ ndọrọndọrọ nke 2019. Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si weta akụkọ, ndị ọnụ na-eru n'okwu na PDP Abịa steeti pụtara n'igwe ịhụ na ntuliaka a gara nke ọma. Okezie Ikpeazu tụnyere akwụkwọ ntuliaka ya nke ga-eme ka ọ mara ebe ọ kwụ n'ịzọ ndọrọndọrọ nke 2019 Ndị dịka Omeiwu Enyinnaya Abaribe, Omeiwu Mao Ohuabunwa, T.A Orji na ndị ọzọ pụtara bịa tụnye akwụkwọ ntuliaka ha na ya bụ ọgbakọ. Abaribe bụ omeiwu na-anọchite anya ndị Abịa Saụt n'ụlọomeiwu ukwu Ohuabunwa bụ omeiwu na-anọchite anya ndị Abịa Nọt n'ụlọomeiwu ukwu T.A Orji na-achọ ịzọ ọkwa ịnọchite anya ndị Abịa Sentralụ ọzọ na 2019, pụtakwara mee ntuliaka Ka o si gaa n'Enugwu steeti Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na PDP ahọpụtala Ifeanyi Ugwuanyi a na-etu 'Gburugburu' dịka onye ga-anọchite anya ha na ntuliaka 2019. Ugwuanyi kelere ndị mmadụ maka ịhọpụta ya Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu kpọpụtara Ugwuanyi, ma jụọ ma o nwere onye ọzọ ha chọrọ ka ya na ya zọọ ya bụ ọkwa, ha sị mba. E debanyere aha ya dịka onye ga-azọ ọkwa naanị ya. Ndị niile gbakọtara n'ọgbakọ PDP kwenyere ka Ugwuanyi nọchite anya ha na ntuliaka 2019 Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ndị PDP gbakọtara n'ọgbọegwuregwu Nnamdi Azikiwe (stadium) ji otu obi bịa. Ụgbọala bu Ike Ekweremadu bịa n'ọgbọegwuregwu ebe e mere ntuliaka imeụlọ PDP Nke pụtara na enweghi onye lụrụ ọgụ maọbụ baa mba. Ụgbọala butere ndị otu PDP Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51706649,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51706649,Imo State Politics: 'Echeghị m na pati PDP machịrị Uche Ogbuagu' - Ọnụ na-ekwuru PDP n'Imo,Ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democatic Party' bụ Damian Oparah ekwuola hoohaa na o cheghị na o nwere mgbe ndị patị ya ji machie Uche Ogbuagu.,"Cheta na Uche Ogbuagu na-anọchịte anya obodo Ikeduru n'ụlọomeiwu Imo steeti kwuru na ihe mere o ji wụbanye na pati All Progressive Congress bụ maka ọgbaghara dapụtara na PDP nke Imo. Damian kwukwara na ọ gaghị agbagha ihe Ogbuagu kwuru maka na ọ bụ uche ya ka o na-ekwu. Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma PDP nke Imo steeti a nọ n'ọgbaghara, o kwuru na ọ gaghị asanwu anyị ajụjụ ahụ.; Ọ gara n'ihu kwuo na nnukwu ọgbakọ PDP ga-enwe n'abali asaa nke ọnwa Maachị ga-egosi ọnọdụ patị ahụ nọ ugbua. Ndị ekperima egbuola ihe ruru mmadụ 50 na Kaduna Ndị uweojii kwuru na ha na-enyocha etu ya bụ ihe si mee. Ihe ruru mmadụ iri ise alaala mmụọ na Kaduna steeti site n'aka ndị ekperima. Ndi ekperima wakporo mpaghara Kerawa, Zareyawa na Minda na abalị Sọnde ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ. Zayyad Ibrahim, onye na-anọchite anya mpaghara ndị ahụ n'ụlọomeiwu, gwara ndị ntaakụkọ na ha eliela mmadụ iri ise n'otu ugbua, ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ. O teela aka ndị ekperima kpawa ike na Kaduna steeti. Gọọmentị Kaduna nakwa ndị uweojii sị na ha na-enyocha ya bụ ihe. Dayyabu Kerawa onye ji ọkwa 'councillor' n'okpuru ọchịchị ahụ kwuru na ndị ekperima ahụ na ihe ha ji wakpo obodo ahụ bụ maka na ndị ebe ahụ gwara ndịagha ebe ha na-ezo. Kerawa kwukwara na ọtụtụ ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ. Onyeisiala Gunie Bissau chịrị naanị otu ụbọchị Cipriano Cassama bụbụ onyeisi ndị ụlọomeiwu Guinea Bissau tupu ọ bụrụ onyeisiala nwa mgbe nta Ndị ụlọomeiwu họpụtara Cipriano Cassamá dịka onyeisiala mgbe nsogbu dapụtara na ntụliaka emere na mba ahụ na Disemba 2019. Mana Cipriano riri mbombo ọsọ ka ọ chịchara sọsọ nanị otu ụbọchị, ma na-ekwu na ndụ ya nọ na nsogbu. Nke a mere agbanyeghị na e dubuola onye agha Umaro Cissoko Embaló dịka onyeisiala n'ụlọ oriri na nkwarị n'isi obodo mba ahụ. Gụinea Bissau enwela mwakpo ọchịchị ruru itoolu kamgbe afọ 1980. Etu esi eke nkwụcha gbasara Coronavirus n'ọdọụgbọelu Naịjirịa Onye ntaakụkọ BBC gara ịmata ihe na-eme n'ọdọụgbọelu Port Harcourt kwuru na ndị ọrụ ahụike ""Nigeria Center for Disease Control"" nọ na-enyocha ndị mmadụ si mba ọzọ abata Naịjirịa. O kwuru na ndị ọrụ ahụike ahụ na-enyocha ka ha mara ma ndị njem e bu ahụọkụ, ụkwara, azụzụ maọbụ ekughị ume ọfụma nakwa ahụike ha na nchịkọta. Ha nyerekwara ndị njem akwụkwọ ha ga-eji debanye aha ha ka ọ ga-abụ ihe ọbụla dapụtaranụ , ka ewe mara ka esi esochi ha ma nye ọgwụgwọ. Ndị ọrụ ike ahụ na-enyochakwa mba ha si bata maọbụ agatụla Chiana, Itali, Saụtụ Korea maọbụ Japan nso nso a. Coronavirus Update: Ndị Chaịna anọ amachịrị maka ọrịa a na Jos ebughị ya Iheọma emerela ndị Chaịna anọ amachiri ngagharị maka igbochi mfesa Covid-19 na Plateau steeti. Minista na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire kwuru na ha anọ lafere ije na nyocha e mere ha maka ọrịa ahụ. Cheta na gọọmenti Plateau kpọsara ndị Chaina anọ a eche na ha bu ya bụ ọrịa n'ụbọchị Satọde gara aga. Osagie kwuru na ka o si kwụrụ ugbua, onweghị onye bu ya bụ ọrịa na abụghị sọ nwoke Itali enyochatara ya n'ahụ ya nso nso a. Mịnsịsta ahụike kwuru ihe ndị a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere na Abuja ma na-ekwu na ya bụ nwoke Itali na anabata ọgwụgwọ zuruoke. Ka ọ dị ugbua, ngalaba ahụ na-enyocha mmadụ iri na itoolu na Legọs nakwa mmadụ iri atọ na itoolu na Ogun steeti ya na nwoke Itali chakọrịtara mgbe ọ batara na steeti ndị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị" egwuregwu-48221394,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48221394,Europa League Final: Arsenal na Chelsea ga-agwọ onwe ha ibi na Baku,"Eden Hazard zara aha nna ya wee si n'ọnọdụ ""gbaa ka anyị laa"" wee kpọpụta ndị otu ya na ndagwurugwu ọnwụ.","Nke a pụtara na Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'asọmpi ikpeazụ nke Europa League. Roben Loftus-Cheek bu ụzọ gbanye otu ọkpụ na neeti Eintracht na nkeji 28. Luka Jovic nke Eintracht sara ya ọkpụ ahụ na nkeji 49 n'agba nke abụọ. Asọmpi ahụ lọkatara ka ofe ọkwụrụ were ruo oge ntinye ruru nkeji 30 tupu ọ banye na penariti. Ross Barkley nke Chelsea bu ụzọ gbanye na neeti ndị Eintracht, tupu Haller asaa ya. Caesar Azpilicueta gbanyere ọkpụ nke ya n'aka onye nche bọọlụ ebe Luka Jovic tinyere nke ya n'ime neeti kpọm kwem. Ọzọ Jorginho na Jonathan de Guzman nwetere ọkpụ nke ha gbara. Kepa Arizabalaga ahụ gụm dịka o ji ọkpa ya chedo goolu Hinteregger Davide Zappacosta gbanyere nke ya ebe Kepa chewara ndị Frankfurt obi mgbe o ji ikpere ya kpado ọkpụ Hinteregger gbanyere. N'ikpeazụ Eden Hazard gbanyere ọkpụ mmeri nke Gonçalo Paciencia asataghịnwu. Arsenal mechiri akwụkwọ Valencia Arsenal gwara Valencia na ""ọ ga-adị mgbe ọzọ"" dịka ha ji ọkpụ goolu anọ feere ha aka. Pierre-Emerick Aubameyang ji ọkpụ goolu atọ gbanye Valencia ajụ n'anya na nkeji 17, 69 na 88. Alexandre Lacazette nyeere ya aka gbanye otu ọkpụ na nkeji 50. Nke a kpokọtara goolu niile otu abụọ a gbara ka ọ bụrụ 7-3 ka ha gbatara n'ụkwụ abụọ ha zutere. Ndị Valencia kpakwara ike mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ha enwere olileanya dịka nke mere ndị Liverpool na ndị Tottenham n'asọmpi Champions League n'izu a. Kevin Gameiro nke Valencia nwara ike ya site n'itibanye goolu abụọ chara acha na nkeji 11 na nkeji 58." afirika-51643137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51643137,Marriage crisis: Nwaanyị na-alụ di abụọ etinyela ụwa na gbagharịa,Ndị uweojii nke alakụba nọ na Kano amanyela ọnụ n'okwu gbasara ụmụnwoke abụọ Bala Abdulsalam na Bello Ibrahim na-ekwusi ike na ha bụ di otu nwaanyị akpọrọ Hauwa Mariri.,"Onyeisi ndị uweojii ahụ bụ Gwani Murtala n'okpuruọchịchị Kumbotso kwuru na ya bụ okwu di egwu nke mere ka ha buru ya gawa isi ụlọọrụ ha. O kwuru na ha mere nke a maka na di nke mbụ nwaanyị ahụ gwara ha na ka afọ gachara , na ya batara hụ na nwoke ọzọ na-alụzị nwunye ya. Mana Hauwa Mariri gwara ndị ntaakụkọ BBC na dị ya nke mbụ gbara ya alụkwaghịm tupu ọ gawa njem n'ime obodo. Nke a mere o ji lụrụ dị ọzọ. Hauwa onye mụtarala ụmụ isii n'aka dị ya nke mbụ nakwa otu nwa na afọ ime n'aka dị ya nke abụọ kwuru na Bello ji ọnụ gba ya alụkwaghịm , o deghị ya n'akwụkwọ dịka ụka alakụba si eme. Bello bụ dị ya nke mbụ kwuru na onweghị mgbe o ji gba ya alụkwaghịm. Di ya nke abụọ kwuru na Hauwa kọwatara ọfụma na di ya nke mbụ gbara ya alụkwaghịm mere o ji lụwa ya. Sheik Nazifi Inuwa bụ ụkọchukwu alakụba nọ na Kano kwuru na ikpe mara di nke abụọ makana ọ jụghị ese ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44755779,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755779,"Mmerụaka NYSC: Adeosun, APC ekwubeghi okwu",Minista na-ahụ maka ego na akụnaụba Naịjirịa bụ Kemi Adeosun ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ebubo mmerụaka e boro ya maka asambodo NYSC ya.,"Adeosun ṅụrụ iyi ọrụ dịka minista n'afọ 2015 Ndị ntaakụkọ 'Premium Times' depụtara na Adeosun ghọrọ aghụghọ maka asambodo NYSC ya n'ụbọchị Julaị 7. Mgbe ụlọọrụ BBC kpọrọ minista Adeosun ịjụta ya maka ya bụ ebubo kamgbe a nụrụ akụkọ a, ọ zaghị ekwenti ya maọbụ depụta ihe ọbụla n'igwe soshal midia ya. BBC gbakwara mbọ ịnụta okwu n'ọnụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchi APC. Mgbe BBC kpọrọ onye nkwuchite ọnụ onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina, ọ sị ka e nyeruo ya elekere 12 nke ehihie tupu ọ zaa anyị ajụjụ gbasara mmerụaka a. Anyị ga-eche ya ma wetekwara ụnụ ihe ọbụla ọ zara anyị mgbe ahụ. Ihe a na-ekwu na soshal midia Kamgbe ndị ntaakụkọ 'Premium Times' depụtachara maka mmerụka ahụ, ndị mmadụ na-etinye ya ọnụ na soshal midia ebe ọtụtụ na-agwa Adeosun ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm ma ọ bụrụ na ebubo a bụ eziokwu. Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP @OfficialPDPNig na-akpọku onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ chụọ ma nwụchie Adeosun maka mmerụaka a. Femi Fani-Kayode @realFFK kpọkukwara Adeosun ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm. Ayisha Osori @Naijavote bụ onye odee akwụkwọ a ma ama kwuru na ọ bụ ihe ihere ma ọ bụrụ na ndị ụlọ omeiwu enyochaghị Adeosun nke ọma tupu ewee ya n'ọrụ. Onye na-akọwapụta ihe gbasara ọchichị na mmepe obodo bụ Dọkinta Joe Abah kwuru na ọ bụrụ eziokwu na Adeosun ghọrọ aghụghọ maka akwụkwọ NYSC ,ọ bụ iwu na-aga achụ ya n'ọru ma makwa ya ikpe. Anyị ga na-ewetere unu akụkọ a dịka o si aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45244019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45244019,Nwaanyị amụọla ejima anọ n'ogbe ndị gbara ọsọ ize ndụ,Akụkọ ndị dị mkpa: Nwaanyị amụọla ejima a nọ na Zamfara,"Otu nwaanyị amụọla ejima anọ n'ogbe ndị gbara ọsọ ize ndụ na Zamfara steeti. Nna ụmụaka ahụ gwara ndị ntaakụkọ na nwunye ya amụbuola ụmụ asaa nke gụnyere ejima abụọ tupu ọ mụọ ndị a. Ha nọ n'ụlọọgwụ n'isi obodo Zamfara bụ Gusau ugbua. N'otu aka ahụ Ọtutụ afọ agaala ndị agha ala Naijịrịa na-aluso ndị Boko Haram ọgụ Mkpa mkpa kpara n'obodo Mailari eriela isi mmadu iri n'itoolu na Borno steeti mgbe ndị Boko Haram wakporo ime obodo ahụ Mana otu onye ọrụ gbata gbata achọghị ka enye aha ya na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ruru iri isii na atọ. Na mba ofesi Ndị ọrụ gbata-gbata azọpụtala ndụ ihe ruru mmadụ puku iri abụọ na abụọ n'ide mmiri na steeti Kerala n'India. E chere na ihe ruru puku mmadụ ole na ole ka tọrọ atọ ebe ahụ dịka ide mmiri ahụ na-ebelata nwayọ nwayọ. N'Egwuregwu Taa bụ ụbọchị ikpeazụ FIFA nyere ngalaba na-ahụ maka bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF iji tighachi onye bụbu onyeisi ha bụ Amaju Pinnick. Fifa kwuru na-ewepu nke a, na ha ga-amachi Naịjirịa niike maka ị da iwu. Ihe nkiri ụtụtụ a Ọkụ ogene" afirika-57285628,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57285628,Delta state police attack: Umutu na ebe ndị ọzọ awakporola ụlọọrụ ndị uweojii na Delta steeti,"Ndị uweojii atọ alaala mmụọ dịka ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Umutu, Delta steeti n'isi ụtụtụ taa bụ 28 nke ọnwa Mee, 2021.","Edafe Bright bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwuru na, abụọ n'ime ndị uweojii a nwụrụ dịka ha na ndị omekome ahụ na-akwakọrịta mgbọ, ebe ọbara mgbali elu gburu otu n'ụlọọgwụ. Edafe kwukwara na mgbọ tụgburu ndị oji egbe abụọ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ riri mbombo ọsọ mgbe ha hụrụ na ndị uweojii abịaghị igwu egwu. O kwukwara na ndị uweojii gbochiri ebumnobi ndị omekome ahụ ịmụnye ụlọọrụ ha ọkụ nakwa imaburu ngwaọgụ ha, dịka o kwukwara na ndị oji egbe ahụ burula ozu ndị nke ha dịka ha na-agba ọsọ. Mana ndị hụrụ ka ihe mere, kwuru na a mụnyere ụfọdụ ụgbọala nọ n'ihu ụlọọrụ ahụ ọkụ.Ndị uweojii ekwuola na ha na-ama imi n'ala ịchọpụta ihe mere, dịka ha na-arịọ igwe mmadụ ka e zitere ha ozi bara uru gbasara ndị kpara mkpamkpa a. Ebe ọzọ ndị oji egbe wakporola ụlọọrụ ndị uweojii na Delta steeti: Ndị 'Unknown gunmen' gburu otu onye uweojii n'Akwukwuigbo. Ndị uweojii Delta steeti kwuru na ha anwụchiela onyeisi ndị ekperima wakporo ndị uweojii nọ ọrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde. Ndị ji egbe wakporo ndị uweojii nọ ọrụ na nso Otulu Junction, n' Akwukwuigbo dị n'Okpuru Ọchịchị Oshimili North, gbuo otu uweojii ma gbaa otu ụgbọala ha ọkụ . Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Bright Edafe kwuru na ọ bụ ndị amakekwu n'ogbe ihe ahụ mere bụ ndị kpara mkpamkpa ahụ. Edafe sịrị: ""Ọ bụ ndị agboro si Akwuku-Igbo mere ya. Ha gburu otu onye ọrụ anyị mana aka akparala onyeisis ha, ebe nnyocha n'aga n'ihu ugbua."" Ọdachi a na-abịa izu ole na ole ndị ekperima wakpochara isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị na Nsukwa, n'Okpuru Ọchịchị Aniocha South ebe ha gbagburu ndị uweojii atọ. Nsukwa: Ndị oji egbe wakporo ụlọorụ ndị uweojii dị n'obodo Nsukwa dị n'okpuruọchịchị Aniocha, ma gbuo ndị uweojii atọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Mee, 2021. Ha mụnyekwara ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ. Lee ihe onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ka ọ garuru Nsukwa:" afirika-56598482,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56598482,Chukwuma Soludo: Anwụchiela mmadụ itoolu e cheere na aka ha dị na mwakpo ya,Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ekwuola na anwụchiri mmadụ itoolu echeere na aka ha dị mwakpo Chukwuma Solduo n'Isuofia.,"Chukwuma Soludo (kere akwa edo edo n'olu) tupu ya bụ mwakpo emee O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'ụlọ Prof Dora Akunyili Wome's Development Centre dị n'Awka. A wakporo Soludo mgbe ọ gara nzụkọ ndị ime obodo na Isuofia n'ọwa gara aga. Aka ndị uweojii akparala mmadụ anọ ọzọ bụ ndị ha sị na aka ha dị na mwakpo ndị o ji egbe wakporo obodo Isuofia n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Maachị 2021, n'ọgbakọ ebe Chukwuma Soludo na ndị ntorobịa obodo ya na-enwe mkparịtaụka. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikenga Toochukwu kwuru na mmadụ anọ ndị sara asịsa na ha so wee kpaa agwa ọjọọ a. Dịka Ikenga si depụta, aha ndị ahụ ha nwụchiri bụ Mbah Victor - gbara afọ iri atọ; John Olisakwe - gbara afọ iri abụọ na otu; Chigozie Omeh - gbara afọ iri abụọ, na Emmanuel Nnobi - gbara afọ iri abụọ na asatọ. Chetakwa na ndị o ji egbe ahụ tọọrọ Mazi Emeka Ezenwanne onye ji ọkwa Kọmishona na gọọmentị Anambra, mana ndị uweojii kwuru nna ha na-agbasi mbọ ike ịtọhapụ nwa amadi a. Ikenga gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha na-agbanyere ndị uweojii izu iji nyere ha aka buso ndị ekperima agha nke ọma. Echeghị m na mwakpo a bụ ihe ndọrọndọrọ - Soludo Chukwuma Soludo n'onwe ya ekwuola na o cheghị na mwakpo a bụ n'ihi na o so azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti. O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV n'abalị Tọzde. Soludo kwuru sị: ""Ọkwa Gọvanọ Anambra abụghị ihe mmadụ ga-eji wufuo ọbara, ọ bụghị etu anyị si eme n'Anambra."" ""Mụ na ndị niile na-azọ ọkwa a dịcha na mma, ya mere ọ ga-agba m gharịị nke ukwu ma ọ bụrụ na mwakpo a bụ iji memilaa m."" ""Mana achọghị m ikwubi okwu ugbua ka m ghara imebi nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa na-eme ugbua."" Ọ bụ ndị uweojii ka ndị mere mwakpo a chere egbe - Onye hụrụ ihe mere Onyeisi ndị uweojii na ndị otu ya gara nleta n'Isuofia Otu onye hụrụ oge ndi o ji egbe wakporo ọgbakọ Chukwuma Soludo kwuru na ọ bụ ndi uweojii ka ndi ahụ chere ihu dịka ha batara n'ogige ahụ. Maazị Ejimofor Opara bụ otu n'ime ndị na-arụrụ Maazi Soludo ọrụ gwara BBC Igbo na ndị ahu malitere gbawa ndi uweojii egbe ka ha batara ebe ahụ. ""Anyị nụrụ ụda egbe chee na ọ bụ ndị uweojii anyị na ha so na-agba egbe. Anyị wee hụzia hụ ka ndị uweojii ahụ na-ada n'ala, ọbara na-agba."" Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere bụzi ngwere n'ọsọ, ọkụkọ n'ọsọ. ""Ọsọ ndụ ka anyị malitere ịgba."" Cheta na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ọgbakọ Soludo bụ onye na-azọ oche gọvanọ Anambara steeti n'ukpuru pati All Progressives Grand Alliance (APGA) na-eme n'Isuofia n'ụbọchị Wenezde. Maazị Soludo zara ekwenti ya oge BBC Igbo kpọrọ ya mana onweghi ọtụtụ ihe o kwuru banyere ihe mere ya. Ọ bụ na mgbede Wenezde ka kepụ kepụ maka mkpa mkpa n'Isuofia pụtara na soshal media. Chukwuma Soludo (kere akwa edo edo n'olu) tupu ya bụ mwakpo emee Akụkọ ahụ kwuru na ndị oji egbe wakporo ebe Chukwuma Soludo - bụbu onyeisi ụlọakụ ukwu na Naịjiria - na ndi ntoroọbịa Isuofia na-eme nzukọ ma gbuo ndị uweojii abụọ. Maazị Opara kwuru na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ sị: ""Ọ bụghị nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị ka anyi na Soludo gara. Ọ bu okwu Bekee na-akpọ ""stakeholders meeting""ka anyị na-eme n'Isuofia."" Lee ihe Maazi Opara kwuru n'uju ebe a: Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenganyia kwetere na ya bụ ọgbaaghara mere n'ezie mana mana ha ka nọ na nchọpụta ịma ka o siri mee. Mana o kwukwara na ndị oji egbe a tọrọ Kọmịshọna na-ahụ maka ihe mmepe obodo Bekee kpọrọ ""Public Utilities"" bụ Emeka Ezenwanne bu onye amabeghi ebe o nọ ugbua. N'akwụkwọ mgbasa ozi Ikenganyia binyere aka na ya, ndị uweojii Anambara kwuru na ọ bụ dịka onyeisi ndị uweojii n'Anambara bụ Monday Bala Kuryas akpọrọla ndị uweojii gaa nleta ebe ihe amere. Ọ sịkwa na ya ka na-eche ịmata ka o nwere ndị ndị ahụ ekwensu jiri kwara ngwaọrụ meruru ahụ. Anwụchiela otu onye maka ihe a mere. gwara BBC na ọ bụ ndi Onye bụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Peter Obi, etinyela ọnụ n'ihe mere n'Isuofia n'ụbọchị Wenezde, ma kwuo na ya bụ ihe adịghị mma ma ncha. Peter Obi kwuru nke a n'akara Twitter ya n'ụtụtụ Tọzde. Ọ sịkwa ka ndi nchekwa gbaa mbo nwụchie ndi kpara ike a me gbaa ha n'anwụ." afirika-49310417,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49310417,Nwa agbọghọ ọzọ anwụọla n'ụlọ oriri na Legọs,N'ime akwụkwọ ozi ndị uweojii ziputere ha nyere aha nwa agbọghọ ahụ ka 'Jessica'.,"Ha kwọwara na site n'ihe ha hụrụ, ọ dịka eji akwa tọgbu ya bụ nwaanyị. Ha kwukwara na ha hụrụ ọbara ebe niile n'ụlọ oriri Southbound dị na Morogbo. He ebido kwala nyocha banyere etu ọnwụ nwa agbọghọ ahụ sị mee. Nke a ga-eme ya ugboro anọ a na-achọta nwaanyị atọgburu n'ụlọ oriri n'ọnwa Ọgọst. Ekele Eid-el-Kabir! End of Twitter post, 1 Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela ndị ụka alakụba niile dịka ha na-eme emume akpọrọ eid-el-Kabir taa. Ọ gwara ha nabata udo ma gbara okwu naụka ọsọ. N'otu aka ahụ, aka chịbụrụ Naijirịa bụ Goodluck Jonathan, Bukola Saraki nakwa ndị ọzọ ezigarala ndị ụka alakụba ozi ekele n'emume eid el kabir. Ọzọ, Dr. Uwazurike Daniel bụ kọmịshọna ahụịke n'Ebonyi steeti akatọọla akaụkọ na-efegharị na ọrịa yellow fever egbuola mmadụ iri abụọ n'obodo ahụ Ọ gwara BBC Igbo na akụkọ ụgha ahụ malitere maka na ndị kọmịshọna gara obere ezumike nke Bekee kpọrọ 'Leave' Na mba ofesi Ndị uweojii na mba Norway ekwuola na ha na-enyocha onye egburu n'ime ụka ndị alakụba dịka ihe na-eyi ndụ egwu. Okwu a bịara dịka otu nwoke bu egbe wakporo ụlọekpere ndị alakụba ma gbuo otu onye n'abalị Satọde. N'egwuregwu Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu na nkeji 58. Otu Arsenal jiri ""chizoba"" zaa aha nna ha dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị ihe merie otu Newcastle mgbe ha zutere onwe ha. N'otu aka ahụ Man United na Chelsea na-asọkọta mpi ugbua n'ama egwuregwu Old Tafford. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ PDP azọrọla Bayelsa Otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' emeriela na ntuliaka ndị isioche nakwa kaụnselọ okpuruọchịchị niile dị na Bayelsa Steeti e mere na Satọde 10 Ọgọstụ, 2019. Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Bayelsa Steeti (BYSIEC) bụ Remember Ogbe gwara BBC na ntuliaka a e mere n'okpuruọchịchị asatọ bụ nke kachasị mma na steeti ahụ. O kwuru na pasentị ndị pụtara binyeaka karịrị iri isii, na udo dị dịka enweghi akụkọ ọgbaghara ọbụla maọbụ onye nwụrụ na ntuliaka ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na pati dị iri anọ na anọ n'ime pati iri itoolu na otu so mee ntuliaka, nke otu APC na-eso n'ime ha. Peter Obi asaala ebubo maka akwụkwọ njem mba Amerịka Onye ji aha PDP zọọ ọkwa osote onyeisiala bụ Peter Obi akatọọla akụkọ na-efegharị, nke kwuru na a jụrụ inye ya akwụkọ ikike ịga mba Amerịka. Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Valentine Obienyem kwuru na Obi nọ na mba Amerịka mgbe akụkọ ahụ na-efegharị. Valentine sị na onye ọbụla maara na Peter Obi bụ onye eji eje mba nke mere na ọtụtụ ụlọọrụ nakwa mba ga-achọ ka ya na ha nwee mmekọ. O kwuru na ndị buru akụkọ ụgha a n'isi bụ ndị maara ụdị nkwanye ugwu na-abịa n'ebe Obi nọ ma ha chọrọ imebisi aha ọma ya. Akụkọ nọ na-efegharị ụbọchị ole na ole gara aga, ọkachasị na soshal midia kwuru na ụlọọrụ mba Amerịka jụrụ inye Obi akwụkwọ ikike njem n'ihi nrụrụaka na mpụ. Buhari na Ramaphosa ga-ezukọ n'Ọktoba Onyeisiala Mohammadu Buhari anabatala ọkpụkpọ oku onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kpọrọ ya ka ha nwee nzukọ n'ọnwa Ọktoba. Onye enyemaka Buhari na mbasaozi bụ Garba Shehu kwuru na Buhari nabatara ọkpụkpọ oku a iji kwụsị oke ogbugbu ụmụ Naịjirịa na mba Saụt Afrịka. Na mba Chaịna Oke mmiri ozuzo a kpọrọ Typhoon Lekima egbuola mmadụ iri abụọ na asatọ ma chụpụ mmadụ karịrị otu nde n'ebe obibi ha na mba Chaịna. Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ọ bụ mbuze so oke mmiri ozuzo a gburu ọtụtụ mmadụ, ebe a ka na-achọ mmadụ iri achọ. N'egwurgwu Tottenham Hotspur esorola nzọm ụkwụ Liverpool na Manchester City nwete mmeri n'asọmpi Premier League malitere na ngwụcha izuụka. Ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie Aston Villa, ebe Burnley na Brighton nwetekwara mmeri. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-51132545,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132545,E kwesiri imeghari ntuliaka eji họpụta Uzodinma - Nnamdi Kanu,"Onyeisi otu na-achọ ka ekwewapụta mba ha kpọrọ Biafra na Naịjirịa bụ ""Indigenous Peoples of Biafra"" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu sị na e kwesiri imegharị ntuliaka nke nyere Hope Uzodinma ohere ị bụrụ aka na-achị Imo steeti.","Kanu kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara Facebook Radio Biafra London ụnyaahụ. Ọ sị na mmeri Uzodinma site n'ikpe ulọikpe Ukwu Naịjirịa kpere bụ ihe mmegide dịrị ndị Igbo makana ọ bụ ụzọ ndị ọ sị bụ ndi ""Fulani"" jiri si chọọ ịchị ala Igbo. Ihe ọzọ ọ sị mere ikpe a ekwesịghị ịkwụ bụ makana ""ọ ga-abụzị usoro a ga-eji na-ekpe ụdịrị ikpe a site n'atụmatụ Bekee kpọrọ Legal Presedence"". N'ịga n'ihu, Maazi Kanu sị: ""Ihe e kwesiri ime bụ ịkagbụ ntuliaka a kpam kpam ka ndị Imo jiri aka ha họpụta onye ga-achị ha."" Maazị Kanu kwukwara na ọ bụ ezigbote ihe ọjọ mmadụ ibinyere onye masịrị ya aka ma emecha onye ga-emeri abụru onye ahọpụtara n'Abuja. Ọ sị na ọ bụ ihe mere ya jiri sị na ""Fulani ewerela ọnọdụ n'Imo steeti."" Ọ sịkwa: ""Ihe a ha mere n'Imo bụ ụdịrị ihe ha na-eme n'ala Igbo kemgbe, nke bụ ịmanye ndị Igbo eze, dika ndị Briten meburụ na mbụ. Ọ sị na ihe mere ndị mmadụ anaghị eme ngaghari iwe maka ihe na ihe ndi ọzọ bụ maka ụdịrị agwa gọọmentị Naịjirịa kpasịrị Ipob. N'ime ozi ya, Maazi Kanu jụrụ ndị otu ya ma ""o nwere ihe oma ga-apụta n'ọchịchị Hope Uzodinma?"" Ihe ọzọ o tinyere ọnụ n'ozi a bụ atumatu nchekwa obodo aka na-achịgasị steeti dị iche iche na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa Hibere. Kanu sị na ya na ndị otu ya ga-enye atụmatụ a nkwado nke gunyere inye ndị Ọdịda Anyanwu ndị mmadụ ga-ensonye na ya bụ atụmatụ. ""Atụmatụ bụ ihe anyị chere oge anyị hibere ngalaba anyị kpọrọ ""Biafra Secret Service (BSS), ya mere anyị ji akwado ya ọfuma."" ""Ugbua, ị gaghị anụ maka mwakpo nwaanyị maọbụ mkpa mkpa ndị Fulani n'Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa."" Ihe ọzọ o tinyekwere ọnụ bụ ihe ọ sị bụ etu e jiri na-agba ndị Ipob mgba okpuru, nke ọ sị na Facebook, Reuters, Channels TV nakwa BBC Igbo so na ndị na-eme. Dịka o si na-ekwu kwamgbe, Kanu si na ndi ntaakụkọ bu ndị ilo ya na Ipob makana ọ bụghi ihe ọ chọrọ ịnụ ka ha na-ede. Agbanyeghị okwu Kanu kwuru, mkpebi Ụlọikpe Ukwu maka Imo enweghi mgbagha. Ọchịchi Hope Uzodinma abụrụla ihe ga-aga n'ihu ruo afọ anọ etụ ọbụla o siri gaa. Akụkọ ga-amasị gị: Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya" afirika-45094968,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45094968,2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abia steeti,BBC Igbo na-agba ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abịa n'anwụ tupu ntuliaka 2019 eruo.,"Ajụjụ BBC Igbo jụrụ n'elu soshal midia ma 'e nwere ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịzọ ọchịchị n'afọ 2019' mịtara mkpụrụ. Kedụ onye ị ga-akwado n'ime ndị a chọrọ ịnochi ndị Abịa? Ụlọomeiwu nta 1. Ejikeme Alozie-Nwagboso dị afọ 36 bụ ọgụ ego nke Bekee kpọrọ 'accountant'. Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ụkwa West n'ụlọomeiwu nta. 2. Adaeze Nnenne Nwokeukwu dị afọ 31 bụ dọkịta. Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isiala Ngwa North n'ụlọomeiwu nta. Gọvanọ Fortunes Paul Okoronkwo dị afọ 36. Ọ bụ onye Isuikwuato chọrọ inọchi Okezie Ikpeazu dịka gọvanọ. Ụlọomeiwu nke steeti 1. Chidinma Eni dị afọ 30 bụ onye Ọhafịa. Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ohafia South N'ụlọomeiwu nke steeti. 2. Victor Chinedu Ogbonna dị afọ 31 bụ ojiegoachụego. Ọ chọrọ inọchite anya ndị Isuikwuatọ n'ụlọomeiwu nke steeti. 3. Njoku chidiebere dị afọ 29 bụ onye ọrụugbo. Ọ chọrọ inọchite anya ndị Osisioma Ngwa North n'ụlọomeiwu nke steeti. 4. Ikenna Uchechi Ogbonna dị afọ 28. Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isuikwuato n'ụlọomeiwu nke steeti. Cheta na nso nso a, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ mere ka ndị ntorobịa Naịjirịa nwee ike ịzọ ọkwa ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48829331,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48829331,Amaju Pinnick 'azọkarala nsị aboki' dịka ụlọikpe sị ka anwụchie ndị NFF?,"Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyeela iwu akpọrọ ""Bench Warrant"" na Bekee banyere ikpe metụtara onyeisi otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick na mmadụ anọ ọzọ.","Amaju Pinnick bụ onyeisiala NFF Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nyere iwu a maka na ndị a abịaghị ụlọikpe ịzara ọnụ ha maka ịgbari ego ndị Nigerian Football Federation (NFF). Ndị e nyere iwu ka anwụchie gụnyere odeakwụkwọ NFF bụ Sunusi Mohammed; osote onyeisi NFF nke mbụ bụ Seyi Akinwumi; Ndị ọzọ bụ osote onyeisi nke abụọ bụ Shehu Dikko na onye ọzọ bụ Yusuff Fresh. Mmadụ nille a kpọrọ aha abịaghị ụlọikpe n'ụbọchị Monde nke ọkaiwu na-ama ha ikpe bụ Celcius Ukpong ji sị ka anwụchie ha bụ nke ọkaikpe nyere ikike a. Gọọmentị etiti site na ndị ọrụ ọtawaike na-ahụ maka iweghachị akụnaụba gọọmentị gbara ndị ọrụ NFF akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịgbari ego dị nde dọla 8.4. Ozi NFF zitere BBC na-akọwa na-ọkaikpe gụpụrụ Maazị Pinnick n'atụmatụ, ma kwukwa na NFF ewegarala arịrịọ ga-aka Ọkaikpe inke Naịjirịa ka o tinye ọnu n'okwu a, ọkachasị maka Pinnick na ndị ọzọ n'ọrụ ọha n'Ijipt. Akụkọ ga-amasị gị:" 43137889,https://www.bbc.com/igbo/43137889,Ụmụakwụkwọ 50 efuola na mwakpo Yobe steeti,Gọomentị ndị Yobe steeti ekwuputala na a na-achọ ụmụakwụkwọ ruru 50 na Yobe steeti ka ndị bu egbe echere na ha bụ ndị Boko Haram wakporochara ụlọakwụkwo ha,"Ndị nkuzi n'ụlọ akwụkwọ awakporo nọ na-achọ ndị ụlọawkwụkwọ ha Onye ntaakụkọ gwara BBC na-achọtala mmadụ iri n'ime ụmụakwụkwo ahụ gbara ọsọndụ ka aka na-achọ ndịọzọ n'ọhịa. Ndị bu egbe zọbatara n'ime obodo ahụ ma gaba n'ụlọakwụkwọ sekondịrị ahụ. Mgbe ha ruru ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi ha agbabala n'ime ọhịa. Kemgbe ugbu a, a matabeghị ọnụọgụgụ ndị ka nọ n'ime ọhịa ebe ndị obodo Dapchi ebe nke a mere so achọ ụmụakwụkwọ a. Cheta na ndị Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok 276 n'ụdị mwakpo yiri nke a na afọ 2014. Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na ndị a bu egbe bukwa ụgbọ agha ruru iri n'abụọ n'ọnụọgụgọ were bata obodo ha. Ndị a malitekwara ịgba egbe ma na-atụkwa ogbunigwe n'ụzọ mwakpo. Ọtụtụ n'ime ndị ụlọakwụkwọ ahụ na Dapchi dịka ndị Chibok atọrọ n'afọ 2014" mba-uba-46129281,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-46129281,Thousand Oaks Shooting: Ekwuola aha onye ji egbe gbuo mmadụ 12 na California,Nkwafụ ọbara enweghi isi na ọdụ ataala isi mmadụ iri na abụọ n'obodo California dị na mba Amerịka.,"Ndị uweojii sị na ihe mgbawa obi a mere n'ebe a na-ere mmanya na mpaghara akpọrọ Thousand Oaks. Ndị uweojii kwuru na onye mere ihe a bụ nwoke dị afọ 28 aha ya bụ Ian David Long. Nkọwa ndị uweojii bụ na onye a nwere ihe a na-eche na ọ bụ isi mgbaka. Onye a bụbụ onye agha Amerịka gburu onwe ya ka ọ kpachara ike a. Kedụ etu ihe si mee? Ndị uweojii sị na Long yi akwa ojii wakpoo ime ebe a na-ere mmanya ka ọ gbagbuchara onye nọ ọrụ nchekwa ebe ahụ. Ndị mahadum nọ n'akụkụ na-agba egwu mgbe nwoke a tụrụ ihe Bekee kpọrọ ""Smoke Grenade"" tupu ọ gbanyewe egbe n'etiti igwe mmadụ. Ebe a egbụrụ mmadu bụ ebe ndị mmadụ na-anọkarị Amerịka na iji egbe egbu mmadụ Igbu mmadụ dị ka ewu ịta nri n'Amerịka bụ mba onye ọbụla tozuru etozu nwereike ibanye ahịa egbe goro ụdịrị egbe ọ chọrọ. Ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị otu pati Demokrat, chọrọ ka e mee ka ọrịa ahụ ndị isi mgbaka maọbụ ndị eji ajọ ntị ike mara, ghara iwe ohere metụ egbe aka, mana ọtụtụ ndị ọzọ achọghị nke a. Ndị nọ n'isi ndị achọghị ka e nwee mgbochi ọbụla bụ ọtụtụ n'ime ndị otu pati Repọblịkan na ndị otu NR - bụ 'National Rifle Association', otu ndị hụru egbe n'anya. N'ime izuụka abụọ gara aga, otu nwoke wakporo ebe a na-eme ihe Bekee kpọrọ ""yoga"" na Florida, ka onye ọzọ wakporo ụlọụka ndị ofufe Jew gbuo mmadụ iri na abụọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48175867,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48175867,Anambra state: Aka ndị uweojii akparala di na nwunye rere nwa ha,Ndị uweojii n'Anambra steeti anwuchiela di na nwunye rere nwa ha mụrụ ka ọ gachara abalị atọ.,"Nke a mere ka ama gbaara ha n'Area Command Ihiala ebe ha waporo ezinaụlọ Chinonso na Oluebube Anyanwụ bụ ndị Ibiasiegbe n'Imo steeti. Ndị a resiri Sandra Odimege nwa ha narị naịra atọ (N300,000). Sandra bụ onye Umuezike, Amorka nke dị n'Ihiala LGA n'Anambra Steeti. Mmadụ atọ a nọ n'aka ndị uweojii ugbua n'esi rọdụ. Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra sị na ""ahụ dị nwa ọhụrụ ahụ mma"". Mohammed sị na ndị ọrụ ha ewepụla ya bụ okwu ụlọikpe ka ha tinyen anya na ya bụ okwu. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52957233,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52957233,Diezani Alison-Madueke ọ bụrụla nwafọ mba Dominica Republic?,Ọtụtụ ndị mmadụ kpụ Diezani Alison-Madueke bụbu minista mmanụ agbịdị na Naịjirịa n'ọnụ ọzọ na soshal midia.,"Nke ugbua kepukepu si na soshal midia sị na nwaanyị a nọ na mba UK ugbua ka bụzi nwafọ mba Dominica Republic na Caribbean. Mana ntule BBC Pidgin mere gosiri na akụkọ a abụghị ihe ọhụrụ dịka nyocha sị n'aka ụlọọrụ ntaakụkọ Al Jazeera n'afọ gara aga kwuru etu minista a ji nara akwụkwọ mkpuchi mba Caribbean. Nyocha a jikọrọ Alison-Madueke na Praịm minista mba Dominica bụ Roosevelt Skerrit nakwa otu ụlọ dị na New York ọnụego ya nde dọla 2.2. Ha sị na Alison-Madueke zụrụ ụlọ ahụ ma were ya kwụọ ụgwọ iji inwete akwụkwọ mkpuchi nke mba Dominica. Mana ọ dịla na mbụ gọnarị akụkọ a pụtara n'ọnwa Nọvemba afọ 2009. BBC Pidgin amaghị ugbua ma o nwere ihe ọzọ dapụtara n'okwu a nke mere ndị mmadụ ji kpụrụ Diezani n'ọnụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nke a @TenderSoul sị na ọ gbakọ ego niile a sị Diezani zuru na o nweghi ike ile nne ya anya n'ihu. @bo_agboola sị na Diezani ji ha gbaa chaachaa. @TheMrnass jụrụ sị ""onye bụ eze n'etiti Abacha na Diezani?"" Gịnị bụ akwụkwọ mkpuchi? Akwụkwọ mkpuchi bụ akwụkwọ ikike baara ezigbo uru nke ndị nwere ego nwereike ịnata n'aka ọtụtụ mba dị iche iche. Akatọọla ọtụtụ mba dị n'Afrịka, Asia nakwa Caribbean, sị na ha na-ere akwụkwọ mkpuchi a iji kpuchi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbanarị nyocha maọbụ ịma ha ikpe. Akwụkwọ a na-enye ha ikike ime ihe ọbụla na mba ahụ nakwa akwụghị ụgwọ ụtụisi n'ọtụtụ ihe ha zụrụ dgz. Cheta na ụlọọrụ EFCC na-enyocha Diezani kamgbe afọ 2014 maka ebubo mpụ na nrụrụaka dị iche iche mgbe ọ bụ minista mmanụ agbịdị. Ha adịla na mbụ kpachie ọtụtụ akụnaụba ya gụnyere ọla olu na aka ọnụego ya dị nde dọla 40 site na nkwado ụlọikpe. Mba ndị dịka Amerịka na UK na-enyocha Alison-Madueke maka ebubo mpụ na nrụrụaka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45584736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45584736,NAPTIP achụọla mmadụ isii chọrọ ị rabaa ụmụnwaanyị ha gbapụtara,Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi mgbere mmadụ achụọla mmadụ isii maka mmehie site n'ịchụ ụmụnwaanyị ndị ha gbapụtara.,"Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa Ihe ndị ọzọ ha na-eme gụnyere ịresi ndị mmadụ akụkọ ịmeụlọ nakwa ịnyere ndị a nwụchiri aka ịgbalahụ nwuchi Naptip mere ha. Ọnụ na-ekwuchitere Naptip bụ Stella Nzan kọwara ihe mere ha ji chụọ ndị ọrụ ahụ n'ike. N'okwu ya ""ọchụchụ ndị a bịara dịka e mechara nyocha imeụlọ dịka iwu hibere Naptip si kwuo"" Ebe Onyeisi Naptip bụ Julie Okah-Donli kwuru na mkpebi ịchụ ndị a n'ọrụ bụ iji kwụsị ndị ọzọ ịṅomi ndị ahụ kpara arụ. Ka o si kwuo ""ngalaba a dịrị Naịjirịa nakwa mba ndịọzọ mkpa ya mere n'uche anyị bụ na ndịọrụ anyị ga-agba mbọ ịso iwu anyị hibere"". Ọ bụrụ na ị chọrọ ị kpọtụrụ ndị NAPTIP maka okwu gbasara ndị na-agba mgbere mmadụ,nweta ha na: info@naptip.gov.ng+234703000020308002255627847 Ị chọkwa ịme mkpesa maka onyeọrụ NAPTIP nara gị aka azụ maọbụ nrụrụaka ọbụla ziga ozi na reformsunit@naptip.gov.ng" afirika-43412815,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43412815,Ụmụaka Dapchi: Ọgụ adaala n'etiti Buhari na Jonathan,Onyeisiala Mohammadu Buhari kwuru na ọ ka onye bụburu onyeisiala n'oge gara aga bụ Goodluck Jonathan mma na-ileba anya na ntọrọ ụmụaka akwụkwọ.,"Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. O kwuru nke a ụnyaahụ mgbe o mere njem nleta n'obodo Dapchi nke Yobe Steeti, bụ ebe atọrọ ụmụaka ahụ n'ọnwa gara aga. Ọ katọrọ ọchịchị Jonathan na nleghara anya ụmụakwụkwọ Chibok mgbe atọrọ ha n'afọ 2014, ma kwuo na ọ bụ enweghị uche. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ a bụ ndị atọrọ Mana Okwu Buhari a ebutela ọsịsa dị icheiche site n'aka ọtụtụ ndị mmadụ. Onye na-ekwuchite ọnụ ndị otu 'Bring Back Our Girls' bụ Sesugh Akume ekwuola na onyeisiala agbalịghị. Akume kwuru, ""Obi adịghị anyị ụtọ, ihe a bụ afọ anọ atọrọ ụmụaka Chibok, ugbua o meela n'obodo Dapchi dịka ọchịchị Buhari na-eme otu njehe Jonathan mere n'oge nke ya."" ""O ruola otu ọnwa atọrọ ụmụaka ahụ, mana ugbu a ka Gọọmenti na-aga ebe ahụ."" ""Agbanyighị asị niile ha tụrụ na ha-agbapụtala ụmụaka Dapchi."" Onyeisiala kwere ndị nne na nna ụmụaka Dapchi na ọ ga-agbapụta ụmụaka ahụ atọrọ Onye enyemaka pụrụiche nke Jonathan bụ Reno Omokiri kwuru na nwa Buhari bụ Yusuf Buhari nwere mgbuchi karịa ụmụaka Dapchi. O kwuru na oge atọrọ ụmụaka Chibok, Jonathan kpọrọ oku nzukọ ndị nchekwa, ebe Buhari kagburu nzukọ ndị nchekwa n'oge atọrọ ụmụaka Dapchi. O kwukwara n'oge Yusuf Buhari nwere ihe mberede okproụzọ na Buhari kagburu njem niile onwere, ma gawa ileta nwa ya n'ụlọọgwụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye ọzọ kwuru uche ya bụ Femi Fani-Koyede na tuwita ya; Onye na-ekwuchitere Jonathan ọnụ bụ Reuben Abati kwuru nke ya na tuwita; Ụmụafọ Naịjirịa ndị ọzọ kwuru uche na tuwita;" afirika-48960707,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48960707,Minsterial List: Ihe iwu Naijirịa kwuru maka nhọpụta,"Dịka ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe ji nkịta ọnwụ, ọnyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na a na-akwanye ya ọkụ n'ike iwepụta aha ndị ya na ha ga-arụ ọrụ dịka Minista.","Buhari kwukwara na ndị ya na ha rụbụrụ ọrụ dịka Minista bụ ndị ọ maghị ma ncha, nke mere o jiri sị na ya chọrọ ịhọta ndi ọma ọfụma maka ya bụ ọrụ. Ndị a ha na Buhari rụrụ ọrụ bụ ndị ọkpopụtara aha ha n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2015 - dịka omere ọnwa anọ ọ malitere ọchịchị. Ugbua, ọkarịala otu ọnwa Buhari rigooro n'ọkwa ịchị Naịjirịa nke agba atọ ya, uche ọtụtụ mmadu bụ na ọgaghị egbu oge dịka o mere n'afọ 2015. Kedu ndị a bụ ndị Buhari 'ma ọfụma' ga-abụ Minista? Ndị rụbụrụ Buhari ọrụ dịka minista. A na-eche n'ụfọdụ n'ime ha ga-alaghachite Agbanyeghi na Onyeisiala Buhari sị na ọ bụ ndị ọma ga-abụ minista, iwu Naịjirịa kwuru na ha ga-abụrịrị ndị si steeti dị iche iche na Naịjirịa. Ya bụ, steeti niile ga-enweta opekata mpe otu onye ga-abụ minista ukwu maọbụ nke nta. Muhammadu Buhari Ekwuola na a na-akwa ya ọku maka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka minista Usoro a bụ ihe iwu jị Naịjirịa - bụ nke Bekee kpọrọ ""constitution"" - kwuru. Mpaghara 14 (3) n'ime iwu sị ""Ndị ga-eso ọchịchị Naịjirịa maọbụ bụrụ mapaghara gọọmentị ọbụla ga adị n'ụdị ga-emetụta ndi bi na Naịjirịa niile."" Mpaghara a gakwara n'ihu kwuo na usoro nhọpụta a ga-abụ n'ụdị ga-akwalite atụmatụ a akpọrọ ""Federal Character"", nkwekọrịta obodo nakwa ịhụ na ọbụghị ndị si otu mpaghara n'achị. Ọzọ, mpaghara nke 171 (5) sị na ""Onyeisiala na-arụ ọrụ ya na mpaghara 169 - nke metụtara iwe ndị ga-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ gọọmentị - ọ ga-etinye atụmatụ ""Federal Character"" na ịkwado mmekọrịta n'uche."" Dịka Maazị Joe Abah dere na Twitter ya, nhọpụta Minista dị iche na ịhọpụ ndị ga-eso onyeisiala ala dịka Ode Akwụkwọ Ukwu maọbụ Onye Aka Nri - Nke Bekee kpọrọ Secretatry to State Government na Chief of Staff. Nke a pụtara na ebe dị ka Ọwụwa Anyanwu ga-enwerịri opekata mpe minista ise, dika ọ bu steeti ise dị n'ime ya. Dan Nwafor bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ APC n'Imo Steeti gwara BBC Igbo na ọ dịịrị Onyeisiala ị họrọ onye obula ọ chọrọ dịka mịnịsta O kwuru sị, ""iwu Naijiria nyere onyeisiala ikike ị họrọ onye ọbụla masịrị ya na steeti ọbụla dị na Naijiria i so ya rụọ ọrụ. ""Anyị na-atụkwa anya na ọ ga-esi na steeti dị n'ala Igbo họrọkwa ndị mmadụ. ""Ekpere anyị bụ na ndị ahụ ọ họọrọ ga-echetakwa na ha bụ ndị nnọchite anya ndị Igbo na kabinet."" Okechukwu Enelamah so na ndi rụbụru Buhari ọrụ dịka minista. Okechukwu Enelamah: 'Oke mbụbata ahịa anyị na-eme ugbua ga-anyụ anyị anya n'ọdịnihu'" 43511908,https://www.bbc.com/igbo/43511908,Bill Gate: Atụmatụ nhazi akụnaụba Buhari agaghị emetụ mkpa Naijiria,"Onye ọkacharamara n'ihe gbasara akụnaụba nke a kpọrọ 'economist' bụ Dr Uche Uwaleke, ekwuola na Bill Gate ekwutachaghị ihe o kwuru maka nhazi nkwalite akụnaụba Naịjiria.","Bill Gates bụ osote onye kacha enwe ego n'ụwa niile Bill Gate kwuru n'Abuja na ụbọchị Tọọsde na atụmatụ nhazi akụnaụba Naijiria nke ọchịchị Muhammadu Buhari agaghị egbo mkpa ndị Najiria ugbua. Dịka Gate siri kwuọ, atụmatụ nke Gọọmentị Buharị na-agbakwasa ụkwụ na iwulike ewumewu nke na-enyere akụnaụba aka ma hapụ iwulite ndị mmadụ site na itinye ego na agụmakwụakwu na ahụike. Uwaleke,onye bụ ọkamụta na mahadum nke a kpọrọ, Nasarawa State University, Keffi na bekee sị : ""Igbakwasị nkwalite akụnaụba na itinye ego na ewumewu na itinye ego na nkwalite mmadụ kwesịrị ịna agakọ. ""Ndị mmadụ, ebe enweghị okporoụzọ, ọdọ ụgbọmmiri na ụlọọrụ mmepụta ngwahịa na okporoụzọ, ọdọ ụgbọmmiri na ụlọọrụ mmepụta ngwahịa roads, ebe enweghị ndị ma ọrụ ga-elekọta ya agahi ewelite akụnụba."" Na mkparịtaụka ya na ọnyentakụkọ BBC nwere, Uwaleke kwuru na ihe Buhari na-etinye anya na ya ugbua dịka iru okporoụzọ, ọkụ na ihe dị ọzọ na kwalite akụnụba bụ ihe dị ala Naịjịrịa oke mkpa ugbua. ""Ihe mere anyi ji etinye ego na ewumewu bụ na ọ bụ ihe kachasị dị anyị mkpa ụgbụ a. ọbụghị na gọọment amaghị na agụmakwụkwọ dị anyị mkpa. Agụmakwụkwọ dịkwa mma,"" O kwuru na n'ihi ụkọ ego dịka Naijiria ka sicha na Riseshọn pụta ma bụrụkwa mba nwere sọọsọ otu ihe na-enye ya ego, ọ gaghị adịrị ya mfe ime ihe nile o kwesiri ime otu mgbe. Akụkọ ga-amasị:" afirika-55770539,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55770539,Bride Price and Marriage list in Mbaise: Ihe ọ ga-eri gị ịlụ nwaagbọghọ ọma na Mbaise,A sị na nwoke hụrụ nwaanyị ọ ga-alụ hụrụ ezi ihe nakwa na mma nwaanyị bụ di ya.,"Mana e nwere oge akụkọ na-ekwu na ego e ji alụ nwaanyị n'obodo Mbaise, Imo Steetị dị oke ọnụ ahịa. O nweghi onye ma ebe akụkọ a malitere ma ọ bụ mgbe o bidoro na-efesasị. O meela ka ụfọdụ ụmụnwoke na-agbara Mbaise ọsọ n'okwu ịlụ nwaanyị ma meekwa ka ụfọdụ ụmụagbọghọ Mbaise alụghị di. BBC Igbo sị ka o leba anya n'okwu a maara ma ọ bụ eziokwu na ịlụ nwaanyị dị oke ọnụ na Mbaise. Ụfọdụ ndị lụrụ nwaanyị na Mbaise tinyere ọnụ n'okwu ma kọwaa etu ije ha si gaa n'ịlụ nwaanyị. Ihe ndị lụrụ nwaanyị na Mbaise kwuru Ogechi Duruji bụ onye Ezemeku dị n'Uguta, Imo Steetị sị na ọ lụrụ nwaanyị n'Ahiazu Mbaise Kamgbe afọ 2010. ""Emefughị m nnukwu ego mgbe m lụrụ nwunye m"" - Ogechi Duruji Ọ kwuru na akụkọ a na-akọ banyere ịlụ nwaanyị bụ ezigbo asị ọcha maka na o ji onwe ya amatụ, na o mefughi nnukwu ego n'oge ahụ. Ọ sị na ego o ji n'aka mgbe ọ lụrụ nwaanyị erughi puku narị naịra abụọ (N200,000) ma ego akụisi nwaanyị na ihe ndị ọzọ so ya. Duruji sị na otu ihe wutere ya n'oge ahụ agwụla puku naịra ise (N5,000) a nara ya maka ịjụ ajụjụ. Ọ sị na ya ndị ọgọ kpara nke ọma na ha nabatara ego ihe ndị ji bịa lụọ nwa ha. Otu nwoke ọzọ bụ onye Ekiti Steetị na-achọghị ka a kpọọ aha na-eme ihe ịlụ nwaanyị n'Ahiazu Mbaise kọwara ihe ndị dị n'akwụkwọ ya. ụfọdụ ihe ndị dị n'akwụkwọ ya gụnyere; ego ụmụnna N16,000, otu krate mmanya staụt, krate mmanya beer atọ, sịga, ụtaba, mkpụrụ ọji 36. Nke ụmụnwaanyị bụ N12,000, krate mmanya malt abụọ, efere ụgba na anụ anọ (ndị nwoke na nwaanyị), aṅara, osikapa, anụ na mmanya, ndị ntoroọbịa puku naịra ise N5000. Ọ sị na ngụkọọ ego niile ọ ga-efu nwereike ịbụ otu puku narị naịra na puku iri anọ (N140,000). Ihe nwafọ Mbaise kwuru Otu onye ndu ọdịnala si n'obodo Eziudo dị n'Ezinihite Mbaise bụ Maazị Okenze Nnabugwu Festus sị na Mbaise niile nwere otu omenala n'ihe ịlụ nwaanyị. Ọ sị na ihe gbapụtara ihe bụ na ọ bụ ụmụnna na ezinaụlọ nwe nwaanyị na-ekpebi ihe a ga-eji alụ nwa ha. Ọ sị na ọtụtụ ezinaụlọ na-achọ ka a zụta ihe ndị n'akwụkwọ bụ nke a na-eke ụzọ abụọ, nye ụmụnna otu ebe nna nwaanyị ga-ewere otu. Mana ụfọdụ ndị bịara ịlụ nwaanyị na-enye ego karịa ịzụta ihe ndị ahụ site na nkwerịkọta ezinaụlọ nkwa nwaanyị. Nnabugwu sị na ihe ndị ahụ a ga-azụta maọbụ ego ole ha ga-akwụ anaghị egbochi mmadụ alụghị nwaanyị. Ọ sị na ọ bụghị iwu na nwoke ahụ ga-emecha ihe niile dị n'akwụkwọ, na akwụkwọ ahụ maka ntuziaka. Ọ gara n'ihu sị na ihe niile na-abụ site na nkwekọrịta nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị na nna (ezinaụlọ) nke nwaanyị ọ chọrọ ịlụ." mba-uba-44558258,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44558258,Trump ekwetala ka a kwụsị ikewa ezinaụlọ na-achọ ibanye Amerịka,Onyeisiala mba Amerịka bụ Donlad Trump ebinyela aka n'iwu ọhụrụ ga-ahụ na a kwụsịrị ịnapụ ndị mmadụ gbatara ọsọ ndụ na mba ahụ ụmụ ha.,"Ọtụtụ mmadụ katọrọ Trump maka etu ndị ọrụ na-ahụ maka ime obodo jiri na-ekewa ezinaụlọ, ọkachasị umụaka na nne na nna ha Iwu a Trump binyere aka ga-ahụ na ezinaụlọ anwụchịkọrọ n'Amerịka ga anọkọ. Trump sị: ""Anyị na-ebinye aka na iwu a. A na m ahụ ya ka iwu dị mkpa. Ọ bụ maka ị hụ na ezinaụlọ nọkọrọ ọnụ, ma hụkwa na oke ala anyị na mba ọzọ siri ike."" Ntụgharị uche a Trump mere bịara ka ụtụtụ ndị mmadụ, ma ndi pati ya, nwụnye ya, ma ndị ofufe na ndị isi mba ọzọ katọrọ nkewa ezinaụlọ a na-eme na mba Amerịka ọkachasị ka ndị ntaakụkọ na egosi ụmụaka na-ebe akwa na ndị ọzọ nọ n'ebe yiri mkpọrọ. Mana Trump na-ekwu na onweghị ntụghari uche ọbụla ya mere. ""Oke ala anyị ka siri ike etu okwesiri. Mana anyị chọrọ ịhụ na ezinaụlọ nọkọrọ ọnụ,"" Trump kwuru na ụlọ ọrụ ya, ma sị: ""Anyị hapụrụ ezinaụlọ ka ha nọrọ otu ebe."" N'ụtụtụ ụbọchị Juun 20 ka Trump gbara ama na o nwere ihe ya ga-eme maka ọnọdụ ndị nọ na oke Amerịka na Mexico bụ ebe ọtụtụ ndị a na-abata Amerịka si abata. O kwuru si: ""M ga-eme ihe ga-akwụsị nkewa a ọsịsọ, bụ nke ndị omeiwu ga etinyekwa aka n'ihu."" Tupu chi efo n'ụbọchi ahụ, Trump nọ na-ekwu na yabụru na ndị omeiwu etinyeghị aka n'okwu ahụ, onweghi ihe ya ga-emenwụ. Mana ka chị foro ụbọchị Juun 20 ahụ, okwu Trump na-adazị etu ọzọ. N'ime iwu a o binyere aka, Trump kwuru na ọ bụ echịchị ya ịhụ na ezinaụlọ nọ otu ebe. N'ime nke a, ha ga na-ahapụ ezinaụlọ na otu ọlụ mkpọrọ. Mana, iwu kwukwara na yabụrụ na a na-atu egwu na ụmụaka enweghị ụdịri nchekwa ha kwesịrị i nwe, a ga-ekewa ha na nne na nna ha." afirika-46161946,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46161946,Naira: Gịnị ka N5 ga-azụtanwu ugbua?,"N'ime afọ ole na ole, uru ego dịka naịra ise agbadaala ọfụma, nke mere na ọ na-arazị ahụ ịhụ ihe ọ ga-azụtanwu.","E biputara naịra ise na 'polymer' n'afọ 2007 N'agbanyeghị na e bipụtara akwụkwọ naịra ise ọhụrụ n'afọ 2007, ego ahụ erughị eru wee gbadaa n'uru, ọkachasị ka akụnaụba Naịjirịa malitere ịgbada n'uru. Enwere oge naịra ise nwere ike ịzụta ọtụtụ ihe dịka blomblom, ihe nracha ọtọbịrịbịrị ""chewing gum"" na ""sweet"", achịcha Bekee, mana ugbua, ọ dị ka anaghị ahụ ya n'ahịa ma ya fọdụzịa ihe o nwereike ịzụta. BBC jụrụ ndị mmadụ ""O nwere onye ka na-ahụ ego a anya? Gịnị ka ị ga-ejinwu ya zụta n'ahịa?"" Ihe ha zara Ken Nwankwọ sị na ego a ka dị, mana ebe o si dị njọ bụ na enweghị ihe ọ na-azụtanwuzị ugbua. Ugonna Okeke kwuru na oge ọ na-aga akwụkwọ, onye naịra ise dị ka 'odogwu'. Mana Ezemokwe Ifeanyi kwuru na naịra ise ka na-azụtanwu ihe n'ugwu awụsa ebe o bi. Opara Nkechi kwukwara na n'eziokwu, naịra ise ka na-azụtanwu ihe n'ugwu awụsa. Njirimara ego naịra ise Lee ihe ọzọ ndị mmadụ kwuru na Facebook ndị BBC Igbo: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43848400,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43848400,Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC?,Ọtụtụ ndị otụ pati nọ n'ọkwa ọchịchị akpọrọ APC nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa na-agba mbọ ịwepụ ọchịchị n'aka pati Buhari na 2019.,"Olusegun Obasanjo kwusiri ọchịchị n'afọ 1999 Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati nwereike imalite ijikọ n'izuka na-abia iji wee kwusi mgbagọ ọbụla na ntuliaka na-abia nu. Ndị gunyere na njikọta pati a bụ pati ndị a: 'Peoples Democratic Party(PDP), ụfọdụ ndị isi na All progressives Congress (APC), Social Democratic Pati,' ndị obere pati ndi ọzọ ruru iri abuọ na atọ nakwa 'Coalition for Nigeria Movement (CNM) nke onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo . APC were ọchịchị n'afọ 2015 Ndị bubu onyeisiala na Naịjirịa, ndị isi agha lagoro ezumike nka gunyere onye agha T.Y Danjuma na-akwado mkpokoba a. N'ọnụ otu onye welitere isi na ya bụ mkpoko, ""nke a agaghị adị ka mgbanwo mụtara pati APC. Anyị anaghị ezigara ụlọọrụ INEC aha mgbanwe. Pati ọhụrụ a ga-enye onye ọ bụla ohere ikwuputa obi ya."" Ndị nọ n'ụlọomeiwu na ndị govano ruru iri na itoolu na-akwadoka ya bụ mkpokoba. PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị N'aka nke ọzọ, pati PDP ka a na-atule ma ha ga-agbanwe aha pati ha. Onyeisi pati ahụ bu Uche Secondus kwuru na ya na ndị otu ya ka na-atule ya bụ echic Mana ndị mmadụ na-ekwu na kama igbanwe aha, pati PDP weputa ụzọ dimma dị iche iche ha ga-esi dozie ala Naịjirịa ma wepu APC n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48278552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48278552,Imo State: Ejighi m 'mace' gbaa ọsọ - Acho Ihim,Ndị omeiwu iri abụọ na asaa nke ụlọomeiwu Imo Steeti akwụsịla onyeisi ha bụ Acho Ihim ọrụ n'ihi ibuli mmachị ha machiri ndị isioche okpụrụọchịchị obodo.,"Ha kwuru na o buliri mmachi a na-emeghi ka ha mara ma buru kwa ọffọr na-achị ndị ulọomeiwu pụọ. Ndị ụlọomeiwu mmadụ iri abụọ na otu họpụtara Chiendu Offor nke pati Action Alliance dịka onye ga-anọchị anya Acho Ihim. Ha gara n'ihu chụtuo onye ndu ndị ụlọomeiwu bụ Lugard Osuji ma were Lloyd Chukwuemeka nke Owerri North dochie anya ya. Mana Acho Ihim bụ onye so Uche Nwosu zọọ ọkwa dịka osote gọvanọ Imo Steeti gwara BBC Igbo na mkpebi a ha mere n'azụ na-abụghị n'ime ụlọomeiwu enweghi isi ọbụla O kwuru na adeakwụkwọ ụlọomeiwu anọghị ebe ahụ gụnyere na ọffọr na-achị ụlọomeiwu adịghị mgbe ha mere mkpebi a. Ihim kwuru na akwụkwọ ọ gụpụtara bụ mkpebi ndị isi kọmitee ụlọomeiwu nwere n'etiti dịka iwu ji kwado. O kwuru na ha ga-emezi nghọtaghe a n'ihi na ha bụ ndị nke ya, na onweghi oke nsogbu dị na ya. Onyeisiala Buhari agala njem na Saudi Arabia Onyeisiala Buhari a nabatala ọkpụkpọ oku eze mba Saudi Arabia bụ Salman Bin Abdulaziz kpọrọ ya maka ime njem ala nsọ a kpọrọ Umrah na mba ahụ. Nke a pụtara na Buhari na ndị enyemaka ya ga-azọpụ njem na Tọsde bụ abalị iri na isii ọnwa dịka a ga-atụ anya mbata ya n'abalị iri abụọ na otu. Na Sudan Ndịagha mba Sudan ekwupụtala nkwekọrịta ha na ndị ọchịchị na-ama ha aka n'ihu nwere inyefe ndị obodo ọchịchị n'ime afọ atọ na-abịa Cheta na ndị agha were ọchịchị na mba ahụ n'ọnwa gara aga mgbe ha chuturu onyeisiala ha bụ Omar al-Bashir. N'egwuregwu Akatọọla Man City maka iwepụta ihe onyonyo ebe ndị ọgba bọọlụ na ndị ọrụ ha na-ekwe n'aka ụdị na-egosi ebe e tiri ndị nkwado Liverpool ihe. Mana a matabeghi ndị ọgba bọọlụ na ndị ọrụ ha nọ n'ihe onyonyo ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ' APGA achụpụla Obiano na Bianca n'isi ọchịchị ha Dịka APGA na-akwado ime ọgbakọ imeụlọ ha na-abịa na ngwụcha ọnwa a, ha ekposaala otu ""Board of Trustees"" ha. Ndị otu BOT APGA gụnyere gọvanọ na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano, Bianca Ojukwu nakwa Victor Umeh. Odeakwụkwọ pati ahụ bụ Labaran Maku kwuru na pati ha kpebiri ime nke a oge ha zụkọrọ n'Awka makana oge afọ anọ ndị otu BOT ha ji achị ezuola. Nne nwata nwoke aha ya bụ Ekene Ezenala kachasị mee ọfụma n'ule Jamb akpọkuola gọọmenti etiti nakwa ndị iheọma na-emetụ n'obi ka ha manye ọnụ n'ihe gbasara afọ ole nwataakwụkwọ kwesiri ịdị tupu ọ banye Mahadum. Ihe Oriakụ Ezenala amaghị bụ na ọnụ na-ekwuru UNILAG bụ Salau Tajudeen gwara onye ntaakụkọ BBC na Ekene ga nwaleriri ule ha, mee ọfụma tupu ekwuwe okwu ịnabata ya na Mahadum ha. Ụlọikpe akwụsịla ụlọrụ gọmenti etiti, EFCC ,DSS, Uweojii,CCT, ịgba onyeisi senate bụ Bukola Saraki ajụjụ ọnụ gbasara mpụ na nrụrụaka. Saraki degara ụlọikpe akwkwọ abụọ iji ma aka maka mkpebi Efcc igbachi ụlọ ya karịrị otu. N'Egwuregwu, Italian Open nke afọ 2019 ga-akwa ome egwuregwu tennis akpọrọ Serena williams. Williams onye kwuru na ọ ga-esonyeriri egwuregwu nke French Open kwuru na ugbua ọ na-elekọta ọnya mere ya n'ikpere. N'ofesi, Iwu a emenyeghịrị ndị awakporo n'ike Obodo Alabama dị na mba Amerika ewepụtala iwu ga-akwụsị ikekpa afọ ime n'obodo ahụ. Gọvanọ na-achị obodo ahụ ebinyebeghị aka n'akwụkwọ iwu ahụ mana ụfọdụ ụmụnwaanyị akatọla ya bụ atụmaatụ. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'" afirika-48739408,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48739408,Miyetti Allah: Ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ asaala okwu ha,BBC Igbo gbalịrị ịnụ olu gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ gbasara akụkọ Miyetti Allah ịchekwa ọwụwa anyanwụ.,"Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Anambra zara anyị sị: ""Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, elebaa ya anya tupu a mara ihe a ga-eme ya."" Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ O kwukwara na ọ bụrụ ndị Fulani bi n'Anambra na gọọmentị dị nkwadobe ịlebanye okwu ahụ anya. Ọ sị; ""Ọ bụghị okwu a ga-akpa n'igwe mgbasaozi, ha chọọ ya ha detara anyị akwụkwọ."". N'Abia steeti Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Ogbo ya n'Abịa steeti bụ ọnụ na-ekwuchitere Okezie Ikpeazu kwuru sị: Na gọvanọ ekwuola na o nweghi ndị Miyetti Allah maọbụ Fulani ga-eche nche n'Abịa steeti O kwuru na Abia steeti agaghị akwado ya bụ atụmatụ n'ụzọ ọbụla. N'Ebonyi steeti N'Ebonyi steeti, Emmanue Uzor gwara BBC Igbo na Ebonyi nwere ndị nchekwa bụ ndị uweojii, ndị agha na ndị nchekwa obodo. Ụzor na-elekọta mgbasaozi na steeti ahụ kwuru na udo adịla n'Ebonyi nke mere na ha achọghị enyemala ọbụla n'ebe ahụ. N'ọnụ ya ""Gọọmentị agwala ha chọpụta ndị ajọ mmadụ n'ime ha kpụpụtara ndị uweojii ka ha rụọ ọrụ ha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49355337,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355337,Taraba police killing: Onye uweojii bụrụ gọọmentị ọnụ abanyela ofe dị ọkụ,Ndị uweojii Naịjirịa sị na ha amalitela iime nchọpụta maka onye otu ha gwakasịrị gọọmentị Naịjirịa ahụ na Facebook,"Onye uweojii ahụ kwukwara na ya ga-emegwara ogbugbu ndị agha gburu ndị otu ha atọ na Taraba. Ọ bụ ndị uweojii na Steeti Yobe nwụchịrị nwaamadị a aha ya bụ Sunday Japhet ka odechara ọtụtụ ihe na akara Facebook ya. Onyeisi ndi uweojii na Steeti Yobe bụ, Sunmonu Abdulmaliki gwara BBC Pidgin na ọ bụghị sọsọ gọọmentị ka nwoke a bụru ọnụ na ọkatọkwara ndị ọzọ. ""Ọbụghị sọ aha onyeisiala ka ọ kpọrọ, ọ kpọrọ osote onyeisiala, ndị omeiwu na onyeisi ndị uweojii. Anyị chọrọ ịmata ebumnuche ya."" ""Ọ bụ ụlọọrụ AIG na zone 12 dị na Bauchi ka ọ nọ, makana ọ bụ ebe a ga-anọ nyocha ya ọfụma. Yobe nọ n'okpuru zone 12."" N'izuụka gara aga, ndị agha mere mmehe gbagbuo ndị uweojii atọ na Steeti Taraba. Mgbe BBC Pidgin nwetere onyeisi Zone 12, bụ Basen Dapiya Gwana, ọ sị na onye uweojii a ekwesịghị ide ihe o dere na Facebook nke mere ọ ga-eji zaa ọnụ ya maka nke ahu. ""Anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe anyị, ebe ndị ọkaiwu anyị ga-ama ihe a ga-eme ya."" Onyeisi Gwana ekweghị ikwu ihe ha ji ama onye otu ha ikpe. Sunday Japhet gbara avụvụ na Facebook maka o sị na-eji ya ụgwọ ọnwa nakwa ogbugbu ndị agha gburu ndị otu ha na Taraba. O gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghi ezigbote ihe na ndi ụkọchukwu nke ofufe Kraịst na Alakuba adịghị ekwu okwu maka ihe ndi ọ sị na-eme maka ụjọ na-atụ ha." afirika-51222239,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51222239,Okazi Festival: Ihe mere ndị Emii jiri na-akwanyere Ọkazị ugwu,"Ọkazi bụ akwụkwọ nrị eji ete ofe, ma jikwara ya agwọ ngwọ ngwọ na ihe ndị ọzọ.","Emume ọkazị Emii: Ihe mere obodo a jiri akwanyere akwụkwọ nrị a ugwu Obodo Emii dị n'Imo steeeti nwere oriri ha na-eri maka ọkazị. Ka ha siri kụọ akụkọ ya, ha si na ọ bu nna mụrụ ha aha ya bụ Emii choputara akwụkwọ nrị a ma rie ya hu na ọ dị ya mma na-ahụ. N'oge emume ọkazị a, ndị Emii adịghị ese okwu maọbu lụọ ọgu. Ha sị na oge emume a, onye ọbụla nwereike ga rie nri ebe ọbụla ọ chọrọ. Ọzọkwa bu na ọ bụ naanị ọkazi ka a na-esi n'obodo ahu n'oge emume ọkazị. Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu" afirika-50943992,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50943992,Nigeria Army: Anyị ga-amalite ịdọpụta ndị otu anyị n'akụkụ obodo dị iche iche,"Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na site na mbido afọ 2020, na ha ga-amalite ịdọpụta ndị agha na-arụ ọrụ n'obodo ndị ọgbaaghara nọbu.","Ibok-Ete Ibas bụ onyeisi ndịagha mmiri kwuru na ha ga-eme nke a ma nyeghachị ndị nkịtị ikike nchekwa ma ọ bụrụ na ha nyochaa hụ na udo alọghachịla ebe ndị ahụ. Ụgwọ opekatampe Anambara steeti Gọọmentị Anambara steeti ekwuola na ha ga-akwụwa ụgwọ opekatampe puku iri atọ site n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2020. Don Adinuba bụ ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ steeti ahụ gwara BBC Igbo na gọomentị ga-ebulikwa ụgwọ mmadụ niile na-arụrụ ha ọrụ. Gụọ ya n'uju ebe a: 'Alaghị m obodo n'ekeresimesi a n’ihi na ego adịghị n’obodo' N'ofesi, a maala otu nwaagbọghọ dị afọ iri na itoolu si mba Briten ikpe maka ịtụgide ndị mmadụ asị idina ya n'ike. Nwaanyị ahụ kpuchiri ihu ya ka ọ na-abịa ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe Nwaagbọghọ ahụ a jụrụ ịkpọpụta aha ya, tụrụ asị sị na ụmụokorobịa iri na abụọ si mba Izrel wakporo ya n'ụlọndina dị na mba Saịprọs, n'ọnwa Julaị gara aga. David Moyes bịara maka 'mmeri' David Moyes chịkwaburu West Ham ọnwa asaa site n'ọnwa Nọvemba 2017 David Moyes bụ onye nchịkọta ọhụrụ ndị West Ham, ekwuola na ọ bụ mmeri ka e ji mara ya, ma kwuo na ọbịbịa ya bụ iwetara otu ahụ mmeri ma dọpụta ha n'ogogo ndị ga-agbada Championship. Moyes nọchiri anya Manuel Pellegrini bụ onye West Ham chụpụrụ n'oche n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba 2019. Ndị uweojii anwuchiela otu nwoke ji enyi ya nwaanyị gwọọ ọgwụ ego Otu onye ụkọchukwu ndị ụka uweọcha bụ Segun Philip gbara afọ iri anọ na abụo na nwoke aha ya bụ Adeeko Owolabi gbara afọ iri abụọ na atọ adanyela n'aka ndị uweojii maka ịkpa ntaka ha ji gbuo nwaagbọghọ aha ya bụ Favour Daley-oladele maka ọgwụ ego. Daley-oladele bụ enyi nwaanyị Owolabi bụ nwa akwụkwọ na mahadum Legos steeti. Onyeisi ndị uweojii nke mpaghara Mowe bụ Marvis Jayeola gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ aka odo ka ụkọchukwu ahụ nyere Ọwolabi ka ọ were kugbuo Oladele mgbe ọ kpọtara ya. Owolabi were akaodo Philip nyere ya sụpia isi Favour, ebe ụkọchukwu ahụ were mma beputa obi nwata nwaanyị ahu were sie ọgwu ọ nyere ọwolabi na Nne ya rie maka inwe ego. Anwuchiri Philip na Owolabi n'ime ụlouka ya mgbe ndị uweojii na-achọ Favour dịka nne na nna ya gwara ndị uweojii na nwa ha na-efu. Owolabi sị na ọ bụ enweghị ego na ihe isi ike mere ka ọ tinye aka n'ajọ agwa a. Kọmishọna ndị uweojii sị na ogbugbu nwaanyị a jọgburu onwe ya ma kwukwa na mmadụ atọ a ga erite ụgwọ ọrụ ihe ha mere. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47622781,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47622781,Nekede: Agha otu nzuzo ataala isi ụmụakwụkwọ anọ - Uweojii,Onụ na-ekwuchitere Mahadum 'Federal Polytechnic' Nekede dị n'Imo Steeti ekwuola na ọ bụghị ụmụakwụkwọ ha nwụrụ na nwakpo ndị a na-eche na ọ bụ otu nzuzo mere n'akụkụ Nekede.,"Cheta na akụkọ si n'aka ndị uweojii kwuru na opekatampe mmadụ anọ anwụyụọla anya ebe ọtụtụ merụrụ ahụ, n'ọgụ dapụtara n'etiti otu nzuzo abụọ n'ụlọ akwụkwọ 'Federal Polytechnic' Nekede dị n'Imo Steeti. N'ihi ọgụ na ọgbaghara a, ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi ụlọakwụkwọ ahụ nọzi n'egwu na ihe ize ndụ ugbu a. Otu nwata akwụkwọ bụ Frank hụrụ ka ihe si mee gwara BBC Igbo na nkpamkpa ọjọ a malitere n'izuụka gara aga n'etiti otu nzuzo abụọ bụ 'Aye' na 'Bagger'.Frank kwuru na o bidoro mgbe ahụtara ozu nwata akwụkwọ a, bụkwa onye na-edozi isi n'ihu ụlọ akwụkwọ ahụ. Nke a kpatara ogbugbu e gburu nwata akwụkwọ ọzọ na-agụ ihe ọmụmụ 'Public Administration' n'ogbe ebe akpọrọ South Africa.N'okwu ya ""Nke a mere ha jiri bido gbuwe mmadụ aghara aghara. Ka ọ dị ugbu a, eji m n'aka na ihe karịrị mmadụ anọ anwụọla, mana ejiri m anya m hụ ozu mmadụ anọ"". Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na mmadụ anọ anwụọla. O kwuru na ndị uweojii ejidela mmadụ iri ma nata ha egbe ruru ise dịka ha ka na-eme nyocha iji chọpụta otu nzuzo na-akpa arụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43130016,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43130016,Nwa dike na bọọlụ bụ Didier Drogba esonyela otu Guingamp,Isaac dị afọ 17 bụ nwa onye gbaburu Chelsea bọọlụ bụ Didier Drogba esonyela otu Guingamp.,"Isaac Drogba chọrọ ịgbachitere ndị England bọọlụ n'ogo mbaụwa Isaac Drogba bụ onye goolu dịka nna ya, gbabuuru ụlọnkuzi bọọlụ Chelsea. Ọ na-agafe Guingamp ka afọ 16 gachara oge nna ya binyere aka isi otu Le Mans gafee Guingamp ka ha kwụchara £80,000 iji gote ya. Didier Drogba nyere goolu 24 ugboro 50 ọ gbaara ndị Guingamp bọọlụ, dere n'igwe okwu Instagram sị ""M na-anya isi maka gị Isaac Drogba"" Mmadụ abụọ ha na Drogba gbakọrọ bọọlụ na Chelsea so na ndị sara ihe o dere. Frank Lampard dere sị ""Ndeewo! Echetara m Isaac dịka nwantakịrị ahụ na-akwanye ugwu! Ugbua ị bụ dimkpa!"" John Terry dere sị ""Enweghị m ike ikweta etu ọ ha na nnukwu ugbua, ndeewo o."" Didier Drogba anọzughị afọ abụọ na Stade de Roudourou nke ndị otu Guingamp, tupu ọ gafee Marseille ebe ọ nọrọ otu afọ tupu o sonye Chelsea n'afọ 2004. O mechara bulie iko Premier League ugboro anọ, iko FA ugboro anọ na iko Champions League, ma gbakwara ndị Ivory Coast ugboro 104. Oge agbara ya ajụjụ ọnụ n'afọ 2015, Drogba kwuru na nwa ya nwoke ọ mụrụ oge ọ na-agba na France, chọrọ ịgbara ndị England bọọlụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43613344,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43613344,Saụt Korịa zipụrụ ụgbọ agha mmiri na Ghana,Mba Saụt Koria ezigala ugbo mmiri agha na Ghana ka ndi omekome nọ na oshimiri tọọrọ ndị Koria atọ.,"Ụgbọ aghammiri ndị Saụt Koria nọbụ na ""Gulf"" nke Guinea Ndị Koria a atọọrọ nọ n'ime ụgbo mmiri akpọrọ Marine 711 bu mmadụ 40 ọzọ bụ ndị Ghana mgbe ndị omekome a wakporo ha na ubọchị Mondee nke izuụka gara aga. Ndi omekome a nwuchikọrọ ndị Koria wee jiri obele ụgbọ mmiri na-agba ezigbo ọsọ gbafuo. Ka ihe a mechara, Marine 711, bụ ụgbọ ji akwụkwọ ikike ndị Ghana, were gawa ọdọụkpọmmiri na Ghana ebe ndị isi ojii o bu rituru, dịka ndi ntaakụkọ Yonhap nke Saụt Koria kwuru. Ndịagha Saụt Koria na-akọwa na ọ bụ ndị Naijirịa kpara ya bụ ike. Ụgbommiri nke Saụt Koria akpọrọ ""Munmu the Great"" nọ bụ ebe a na-akpọ ""Gulf of Eden"" na arụ ọru nchekwa tupu e ziga gawa ka ọ ga zọpụta ndị ahụ atọọrọ. Mpaghara gọọmenti Kọria na ahụ maka ihe gbasara mba ofesi kwuru na ha na ndị Naịjirịa, Ghana, Togo na Bini nakwa Amerịka na Europe na gba mbọ ịhụ na ndị ahụ pụtara. Ndị omekome kpara ike a ekwụbeghị ebumnobi ha, maobị egole ha ga eji tọghapu ndi ha ji. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-51201018,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51201018,Chelsea vs Arsenal: Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka,Arsenal takwutere ya kọnkịrị n'aka Chelsea mana ha gosiri ike dimkpa iji jide onwe ha.,"E nyere David Luiz 'red card' na asọmpi ahụ Otu abụọ a nyere onwe ha goolu abụọ abụọ oge ha zutere na 'Stamford Bridge' n'aabalị Tuzde. Ndị Chelsea che na asọmpi ahụ ba-abụ ofe nkupu mana ha hụrụ nke tọrọ 'Bịati'. Oteghi aka asọmpi a malitere, David Louis gbaturu Tammy Abraham n'ime obi goolu ha nke mere ka a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi ma nye Chelsea penariti. Gorginho gbakpuru penariti ahụ wee gbaara Chelsea aka ahịa. Martinelli nyere goolu dị ebube na asọmpi ahụ Chi ndị Arsenal zọrọ ha oge bọọlụ kụrụ Saka n'aka n'ime '18' mana ogbu opi ahụghị ya. Na nkeji 63, Gabriel Martinelli nyere goolu dị ebube wee saara ndị Arsenal ọnụ ha. Chelsea nyere goolu ọzọ si n'aka Ceaser Azpilicueta. Mana na nkeji 88 ka Bellerin nke Arsenal sakwara ya. Otu a ka ya bụ egwu si bee. Sergio Aguero nyere goolu ndị Manchester City ji merie N'asọmpi ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde, Manchester city ji otu ọkpụ goolu merie Sheffield United. Aston Villa si azụ owere lọghachi wee merie Watford 2-1. Bournemouth na Brighton gbara 3-1, ebe Southampton meriri Crystal Palace 2-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn" afirika-46073109,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46073109,Puffer fish: Ụdị azụ ndị na-egbu mmadụ,Ụlọọrụ na-ahụ maka ị gbochi mmepụta ajọ nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) adọọla aka na ntị gbasara azụ akpọrọ Puffer nke,"Ụmụ azụ ndị a na-ebu nsi ọnụ ha sị na-egbu egbu. Ha depụtara ịdọ aka na nti a n'akara websaịt ha. Azụ ndị so na Puffer fish bụ wellfish, fugu, globefish, blowfish, ballonfish, bubblefish maọbụ sea squad. Azụ Ballon so na ndị na-egbu egbu Ha niile bụ nrị anaghị esi n'ọkụ n'obodo Asia gụnyere Japan, China and Korea. NAFDAC kwuru na o nwere nsi ọnụ dị azụ ndị a nke nwereike ime ka mmadụ rịa ọrịa ma si ebe ahụ nwụọ. Ha kwuru na ọ bụ n'akụkụ ahụ dị iche iche azụ ahụ ka ya bụ nsi ọnụ na-adị. Gịnị mere ndị Asia ji erinwu ya? NAFDAC kwuru na ọ bụ sọnsọ ndị osi nrị bụ ndị Asia nwetere ọzụzụ n'ịwepụ ya bụ nsị ọnụ na-ejinwu ya esi nri. A naghị edowe azụ ndị na ntuoyi O nweghị ihe ọ bụla ị ga-emenwu iji wepụ ya bụ nsi ọnụ, ọsọ go dị gị tinye ya na njụoyi maọbụ sie ya esi, ya bụ nsi ọnụ ga-anọkwa ya. Ị tinye ya na njuoyi, nsi ọnụ a ga agagharịwa n'ahụ azụ ahụ. A naghị edowe azụ ndị na ntuoyi NAFDAC na-arịọ ka ndị na-ere nri nakwa ndị na-ere azụ ghara ị nye ya ndị mmadụ ka ha rie maọbụ zụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48755381,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48755381,Samuel Chukwueze: Gịnị ka ị ma maka onye a na-ekwu na ọ bụ 'ọkacha agba na Super Eagles ugbua'?,"A bịa n'ime otu Super Eagles na-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mba Afrịka a na-agba n'Ijipt ugbua, Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ.","Nwaamadị a gbara afọ iri abụọ, so na ndị ọgba bọọlụ batara ọhụrụ ụkwụ na-aghọ ezi nkọ n'ịgba bọọlụ. Super Eagles nke Naịjirịa nke Chukwueze so anọchite anya ha, abụghị ndị ikpeazụ dịka ha so ndị ogbo ha n'Afrịka n'ịnọchiteanya mba ha. Onye bụ Samuel Chimerenka Chukwueze? Chukwueze bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Super Eagles nakwa otu egwuregwu Villarreal nke mba Spen bọọlụ. A mụrụ Chukwueze n'ụbọchị iri abụọ na abụọ, afọ 1999, n'obodo Amaokwe, Ugba, Ibeku dị n'Ụmụahịa, Abịa Steeti . Ọ tọrọ mmadụ abụọ (bụ ụmụnne ya), nwoke na nwaanyị. Agụmakwụkwọ ya Chukwueze gụrụ akwụkwọ na 'Government College' nakwa 'Evangel Sekọndịrị' dịcha n'Ụmụahịa. Njem ịgba bọọlụ ya Chukwueze malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị naanị afọ asatọ. O ji Austin J.J Okocha bụ ""ọgba ncha"" mere onye nlekwasị anya ya. O bu ụzọ gbaara otu egwuregwu ""Future Hope"" bọọlụ, mechaa gbaara ndị ""New Generation Academy"". Dịka ọ na-agbagote n'afọ, Chukwueze banyere otu ""Diamond Football Academy"" tupu o soro ndị otu egwu Naịjirịa 'Golden Eaglets' nọ n'okpuru afọ 17. Maka etu o si mee nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa ndị nọ n'okpuru afọ 17 a gbara n'afọ 2015, otu egwuregwu Villarreal bịara zụrụ ya. N'afọ 2018, Chukwueze malitere njem iso ndị Super Eagles nke Naịjirịa agba bọọlụ n'asọmpi enyi na enyi ha na ndị Yuganda. N'ọnwa Mee afọ 2019, a kpọrọ ya oku iso gbaa asọmpi Iko Mba Afrịka nke na-aga n'ihu ugbua. Etu o si agba bọọlụ Chukwueze bụ ọgba bọọlụ na-agba n'ebe etiti bụ 'Midfielder' na bekee. Ụkwụ na-aghọ ya ezigbo nkọ n'ịgba bọọlụ. Ọ bụ onye ama ama n'ịkpa oke ọkpụkpa na bọọlụ, nke mere ọtụtụ ndị ji atụnyere ya na Arjen Robben nke mba 'Netherland'. Ihe nrite Chukwueze so ndị 'Golden Eaglets' mabute Iko Mbaụwa ndị nọ n'okpuru afọ 17 a gbara n'afọ 2015, bụ ebe ọ bụ onye atọ na ndị kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ. N'afọ 2016, ọ turuugo dịka ""ọgba bọọlụ kachasị gbapụta ihe"" n'otu egwuregwu 'Diamond Football Academy'. Ọ bụ ya ritere nturuugo ""onye ọgba bọọlụ kachasị baa uru"" n'asọmpi Iko MCL n'afọ 2016. Samuel Chimerenka Chukwueze so na ndị a na-atụ anya ga-amụke ka kpakpando n'asọmpi AFCON nke afọ a. Goolu o nyere n'asọmpị ndị Saụt Afịrịka na Naịjirịa mere ya onye atọchasịrị n'ime ndị nyere goolu n'Afcon nke 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46183721,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46183721,#BeyondfakeNews: Akụkọ ụgha enwerela oche n'obodo,"Akụkọ asị na Afịrịka bụ ihe na-ebute ọgụ n'etiti obodo, nakwa mgbagwoju anya n'etiti ndị chọrọ ịtụ vootu na ntuliaka dị iche iche n'Afrika.","Ọ bụ BBC mere nchọpụta a n'ime nyocha ọhụrụ nke a mere na-elebanya n'akụkọ asị n'Afịrịka nakwa etu o si metụtụ obodo dị iche iche n'Afịrịka. Lee akụkọ asị ise malitere n'Afịrịka n'afọ a. 1. Ndị nwoke na-edina nwoke ibe ha akwadoola onye chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala Naịjirịa Gịnị bụ akụkọ a? Oge Atiku Abubakar malitere dịka onye ga-azọ ọkwa ọchịchị onyeisiala Naịjịria n'okpuru otu PDP, otu akara twitter buru aha Atiku bụ akara asị kelere ndị ""Association of Nigerian Gay Men (ANGAM)"" maka nkwado ha na-akwado Atiku. N'ime ozi asị a, ""Abubakar"" dere na ihe mbụ ọ ga-eme dịka onyeisiala bu ikagburu iwu gbasara nwoke na nwoke na-edina onwe ha nke ndị Bekee kpọrọ 'anti-gay legislation'. Cheta na iwu a malitere n'afọ 2014, kpebiri na ọnyeọbụla dara iwu a ga-aga mkpọrọ afọ 14. Gịnị ka akụkọ asị a mere ndị mmadụ? Akụkọ ndị ntaakụkọ dere gbasara akụkọ asị a Ha kesara akụkọ a na Twitter n'ubọchị 14 n'ime ọnwa. Ka o mechara ndị ntakụkọ asịrị abụọ zipuru akụkọ nke ha gbasara ozi a. Mana ụbọchị iri na abụọ n'ihu ndi ntaakụkọ The Nation na Vanguard dere nnukwu akụkọ gbasara ozi a. Ebumnuche ndị malitere akụkọ asị a bụ ka obi gbawa ndị chọrọ ịkwado Atiku na ntuliaka 2019 makana ọtụtụ ndị Naịjirịa kwado iwu a machịrị emume nwoke na-edina nwoke ibe ha. Kedu ka ị ga-ama na akụkọ a bụ akụkọ asị? Akara Twitter ebe akụkọ malitere abụghị ezigbo akara nke Atiku Abubakar. Ezigbo akara Twitter ya bụ nke ndị ụlọọrụ Twitter binyere aka nke ndị Bekee kpọrọ ""Verified accout"". Fake news is often published on legitimate-looking websites N'aka ọzọ, ndị Agence France Press (AFP) lebara anya n'akukọ a, chọpụtara na o nweghị onyeọbụla aha ya bụ Spinky Victor Lee bụ onụ na-ekwuchitere ndị LGBT. 2. Onye ntakụkọ Kenya kesara ekele asị Gịnị bụ akụkọ a? Onye ntaakụkọ CNN bụ Richard Quest gara mba Kenya maka isite ihe nkiri akụkọ ya n'obodo Nairobi. Onye ntaakụkọ Julie Gichuru dere na akara Twitter ya na ọnịnọ mazi Quest nọrọ na Kenya dị ya obi ụtọ. Lee ihe o dere na Quest kwuru. ""Onweghị ihe kachasị na mba Kenya na ịnabata ndị njem n'ala ha. Ugbua anụ giraffe nọketere m ebe m na-eri nrị ụtụtụ. Kenya bụ ala awansi"" Gịnị ka akụkọ a malitere? Julie nwere ndị na-eso ya karịrị otu nde na Twitter nakwa 600,000 n'elu Instagram. Ihe a mere ka ọtụtụ ndị mmadu kweta n'ozi a o zipuru. Mana ọtụtụ ndị mmadụ ọzọ ji ya kpa nnukwu ọchị makana ha chere na onyeọbula lụrụ ọru ntaakụkọ ọtụtụ afọ dịka ya kwesiri ịma na ozi a abụghị nke ezigbo. Kedụ ka anyị sịrị ma na ozi a bụ asị? Richard Quest dere na onweghị ozi ọbula o zipuru gbasara kenya. Gichuru kọwara ihe ọbụla na Twitter. 3. Ndị Somalia dabara n'ili n'Ethiopia Gịnị bụ akụkọ a? N'ọnwa Julai, otu ụlọọrụ ntaakụkọ Ethiopian Satellite Television (ESAT) zipuru ihe nkiri gosi ebe ndị obodo Oromos n'Itiopia na-enubenye ozu ndị Somalia n'ili. Akụkọ a kwuru na a setere ihe nkiri a na Oromia n'ime Itiopia ebe nnukwu ọgụ na-esu. Gịnị ka akụkọ a malitere? Ihe nkiri a gosi ebe a na-eli ndị a BBC nke asụsụ Afaan Oromo kwuru na ihe nkiri a mere ka ndị omekome gbuo ndị Oromo na-ebi na Djibouti na Somalia. Kedụ ka anyi sịrị ma na akụkọ a bụ asị? Ọtụtụ mmadụ malitere na soshal midia na-agba ajụjụ maka ihe nkiri a. Nke a mere ka ndị ụlọọru ESAT kwuo na ihe nkiri ahụ bụ asị. Ha rịọ arịrịọ na Youtube. N'ọnwa Juun, ihe nkiri a malitere ọgụ n'etiti ndị agha Anglophone na ndị agha gọọmentị Cameroon. 4. Onyeisiala Jacob Zuma edeela akwụkwọ arụkwaghị m Gịnị bụ akụkọ a? N'ụbọchị 12 n'ime ọnwa Febụwarị, otu onye ntaakụkọ South Africa Broadcasting Corpoartion kwuru na Jacob Zuma bụbụ onyeisiala South Afịrịka edeela akwụkwọ arụkwaghị m. Tshepo Ikaneng kwuru ihe a oge ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị African National Congress (ANC), ka na-enwe ọgbakọ na-eleba anya na ihe ha ga-eme Zuma n'ihu. Maka Ikaneng, onye ntaakụkọ ọzọ na mba ahụ zipuru ozi na Twitter. Gịnị ka akukọ malitere? Ego South African bụ rand, kpudo isi n'ala maka ọtụtụ ndị mmadụ chere na Zuma ga-eritu n'ọkwa ọchịchị. Ọ bụ akụkọ asị? Onye na-ekwuchitere Zuma kwuru na akụkọ a bụ akụkọ asị. Mana Zuma tinyere akwụkwọ arụkwaghị m na ngwụcha ụbọchị atọ n'ihu. 5. Onyeisiala Tanzania chọrọ iji nkwado ịlụ ọtụtụ nwunye were kwụsị igba akwụna Gịnị bụ akụkọ a? Akụkọ a kwuru na onyeisiala Tanzania bụ John Magufuli gwara ụmụnwoke na ịlụ ọtụtụ nwunye bị ihe ga-akwụsị igba akwụna. Gịnị ka akụkọ a malitere? Ndị ntaakụkọ Zambia Observer bụ ndị dere akụkọ a. Mana ọ bụ oge ndị ụlọọrụ nipasheonline.com dere akụkọ a n'asụsụ Swahili ka ọ bidoro ịwu ewu n'ala ahụ. Ndị ntaakụkọ asịrị JamiiForums dekwara yabụ akụkọ nakwa kesaa ya na mba dị iche iche dịka Kenya, Zambia, South Africa na Ghana. Kedu ka anyị sịrị ma na ọ bụ asị? Onye na-ekwuchitere gọọmenti Tanzania dere na Twitter na akụkọ a bụ asị. BBC Swahili nyochara yabụ akụkọ nakwa chọpụta na ọ bụ asị. Akụkọ asị a kwuru na Magufuli kwuru na Tanzania nwere mmadụ ruru nde 70 mana UN kwuru n'ala ahụ nwere mmadụ ruru nde 60. Akụkọ a so n'ime akụkọ ọhụrụ BBC malitere na-elebanya n'akụkọ asị. Chọpụta akụkọ ndị ọzọ yiri nke a na www.bbc.co.uk/fakenews" afirika-45290382,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45290382,Mukaila: 'Ije m sị Legos gawa Abuja maka Buhari bụ ihe efu',Muhammad Mukaila kwuru na ọ bụrụ na ọ ma ọ kara aga ya bụ njem.,"End of Twitter post, 1 Ọ gwara ndị nataakụkọ na tọọsde na ọ na-ewute ya na o mere ya bụ njem maka ị ṅụ mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka 2019. O jikwa ohere a kwupute mbido njem iwe site Lagos ruo Abuja na-ekwukwa na o mere ya ka o wee gosi gọọmentị Buhari na iwe na-ewe ndị ntorobia Naijirịa makana ha emezughị nkwa ha kwere. Buhari ga-achịrịrị ọzọ -Wogu Mukaila onye bụ akpatị ozu edere laa n'udo APC nke pụtara ""R.I.P APC"" kwuru na ọgaghị a tunyere onye ọbụla nọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị ugbua a. N'ọnụ ya, ""ha kwere anyị nkwa ị nye anyị ọrụ ruru nde atọ mana ha enyewụghị anyị ọrụ ruru puku ise. Ha kwuru na ha ga-ebutu ụgwọ mmanụ ụgbọala ka ọ nọrọ na N45 mana ugbua ọ bụzị naira N145. Ha kwukwara na otu naira na dọla ga ha mana ụgbua ọ na naira N400."" Ya mere anyị ji sị na anyị achọghịzi APC. Mukaila kwuru na ya bụ njem abụghị nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla kwadoro kama o kwuru na ọ bụ ego ya ka o ji mee ihe niile gbasara ya bụ njem. Njem ọ gara mgbe ahụ bụ iji wee gwaa APC ka ha hazie Naịjirịa nkeọma. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: @kcnaija chetara ndị mmadụ ka Muhammadu si wee gaa njem na 2015. Mana onyeisi ndị APC n'Enugwu bu Ben Nwoye kwuru na Mukaila bụ onye ije na-atọ ụtọ. O kwuru na ọ bụ ihe ọjọ na ọ fụghị iheọma niile Buhari mere kamgbe ọ banyere ọchịchị kama na ọ bụ sọ ndị ọ na-emeghị ka Mukaila na-ekwupute. Nwoye kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ egobiela Mukaila ya kpatara o ji ekwu okwu etu ahụ. O kwuru na ya bụ nwoke chọ ya jee elu jee ala, Buhari anwaala nkeọma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-44353290,https://www.bbc.com/igbo/media-44353290,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue ọzọ,Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue ọzọ,Ndị ji egbe a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi gburu mmadụ iri ma meruo mmadụ iri na ise ahụ n'obodo Turan n'ime Benue steeti. Otu n'ime ndị pụtara na ndụ na mkpamkpa a kwuru na ndị a wakpọrọ ha n'etiti isi ụtụtụ oge ha niile na-arahụ ụra. Saraki azahachila ndị uweojii Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki gọrọ akụkọ na-ebo ya ebubo na aka ya dị ohi mere na Offa n'ime ọnwa Epureel. Saraki na ebo onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ebubo ị ji ohi nke a mebi aha ya. Aja ọkụ egbuola ọtụtụ mmadụ na Guatemala Ajọ ọkụ na-abọpụta n'ime ala gburu mmadụ iri abụọ na ise (25) nakwa meruo ihe ruru narị mmadụ ahụ na Guatemala. Ndị ụlọọrụ gbatagba obodo ahụ ekwuola na-ugbua onweghị ụgbọelu na-efebata n'obodo ahụ maka nnukwu ntụ dị na mbarigwe. Super Eagles eruola ala Austria maka nkwadebe iko mba ụwa Ndị otu Super Eagles eruola mba Austria ebe a ga-ebido nkwado maka asọmpị iko mba ụwa ga-ebido n'ụbọchị iri na isi na mba Russia. Cheta na ọgba bọọlụ Mikel Obi kwusiri ike na otu Super Eagles kwesiri igbasị mbọ ike karịa etu esi agba ugbua ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịme ọfụma na Russia. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị: 44036846,https://www.bbc.com/igbo/44036846,Onyeisiala Buhari agala London ọzọ maka njem ahụike,Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya.,"O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem. O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ. O kwuru na dọkịnta ya gwara ya ka ọ bịaghachi nke onyeisiala kwere ya nkwa na ọ ga-abịa. Onyeisiala ga-alọta ụbọchị Satọde abalị iri na abụọ ọnwa a bụ Mee. Shehu kwuru na ọ lọta, ọ ga-aga leta Jigawa steeti, njem e bugharịrị maka nzụkọ ndị APC na wọdụ. Njem ahụ ga-emezi ụbọchị Monde 14 na Tuzde 15 ọnwa a bụ Mee. Cheta na onyeisiala na-anata ọgwụgwọ na London mana ọ gwaghị Naịjirịa aha ihe na-arịa ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46205054,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46205054,World Diabetes Day: Ọrịa shuga nakwa ụzọ ị ga-esi gbalahụ ya,Ọrịa shuga bụ nnukwu nsogbu ahụike na-ata nchara n'ahụ nke na-egbu ihe karịrị otu nde mmadụ kwa afọ- o nweghị onye e nweghị ike ịrịa ya.,"Ihe na-ebute ya bụ ahụ mmadụ enweghị ike igweri shuga dị n'ọbara (glucose). Ọrịa shuga taa nchara n'ahụ, o nwere ike ibute ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ, ikpu isi, mmebi akịrị (kidney failure) na ibe ụkwụ onye na-arịa ọrịa ahụ. Nsogbu ọrịa shuga na-aga n'ihu - Dịka WHO siri kwuo, ihe ruru nde mmadụ 422 na-arịa ya n'ụwa niile- nke a bụ mmaaji anọ ndị na-arịa ya n'afọ 40 gara aga. Na agbanyeghị ka o siri jọọ njọ, ọkara ndị na-arịa ya amaghị na ha na-arịa ọrịa shuga. Mana mmadụ Igbanwe ka o si ebi ndụ nwere ike igbochi ọrịa a. Lee etu i nwere ike isi mee ya: Gịnị na-ebute ọrịa shuga? Ụdị ọrịa shuga a kpọrọ 'Type 1' na bekee na-ebido n'ụmụaka maọbụ ndị na-eto eto nwere ike isi n'ọbara maọbụ nje na-ebu ọrịa Mgbe anyị riri nri mgbadoume (carbohydrate), ahụ anyị na-egweri ya ka ọghọ shuga. Mmiri ahụ (hormone) nke a kpọrọ insulin na bekee nke a na-emepụta na anyịnya (pancreas) na-enye ahụ iwu ka ọ mịkọrọ shuga maka inye ike. Ọrịa shuga na-abịa ma ọ bụrụ na ahụ anaghị emepụta 'insulin' maọbụ na ọ naghị arụ ọrụ nke nwere ike ime ka shuga dọrọ n'ime ọbara. Shuga na-eme ka shuga dị n'ọbara gbalite Kedụ ụdị ọrịa shuga? E nwere ụdị ọrịa shuga dị iche iche. Na nke a kpọrọ 'type 1', anyịnya na-akwụsị imepụta 'insulin', nke na-eme ka shuga gbalite n'ọbara. Ndị ọkachara mara sayensị amaghị ihe na-ebute nke a mana ha kwenyere na o si n'ọbara maọbụ nje na-ebute ọrịa nke na-emebi ọwọ (cell) na-emepụta 'insulin'. Ihe dịka pasent mmadụ iri nwere ọrịa shuga nke 'Type 1'. N'ọrịa shuga nke 'type 2' , anyịnya anaghị emepụta 'insulin' zuru ezu maọbụ nke emepụtara anaghị arụ ọrụ. Mmiri ahụ(hormone) nke a kpọrọ insulin na bekee nke a na-emepụta na anyịnya(pancreas) na-enye ahụ iwu ka ọ mịkọrọ shuga maka inye ike Nke a na-emekarị na ndị gbaliterela n'afọ, ndị na-eto eto, ndị buru ibu, ndị na-anọkarị na-emegharịghị ahụ, nakwa ndị si mba ndịda Asia na-enwekwa ya. Ụmụnwaanyị dị ime nwekwara ike ịria ọrịa shuga nwaanyị dị ime( gestational diabetes) ma ọ bụrụ na ahụ ha enweghị ike imepụta insulin ga-ezuru ha na nwa ha. Ọtụtụ nchọpụta na-ekwu na ihe dịka pasent 6 rue 16 ụmụnwaanyị dị ime ga-enwe ọrịa shuga. Ọ dị mkpa ka ha lebe anya n'ihe ha na-eri, na-emegharị ahụ iji gbochie ọrịa shuaga type 2. Mmadụ nwekwara ike inwe ọnọdu na akwado ịbanye ọrịa shuga- ọnọdụ shuga dị n'ọbaara igbalite elu nke nwere ike ịdaba n'ọrịa shuga. Kedụ njịrịmara ọrịa shuga? Ike ọgwụgwụ, oke agụụ mmirị an oke ịnyụ mamiri Njirimara ọrịa shuga gụnyere: Ụdị ọrịa shuga dị iche iche Dịka ngalaba ahụike mba Birten a kpọrọ British National Health Service, njirimara ọrịa shuga 'type 1' na-esosị onwe ya ọsọ ọsọ n'ụmụaka na ndị na-eto eto. Ndị nke 'type 2 na enyekarị nsogbu bụ ndị karịrị afọ 40 (maọbị ndị sị ndịda Asia ruru afọ 25); ndị ndị mụrụ ha maọbụ nwanne ha nwere ọrịa shuga; ndị buru oke ibu; nakwa ndị sị China, na ndị isiojii. E nwere m ike igbochi ọrịa shuga? Were mkpụrụosisi, mkpụrụ nrị na mmanụ ndị na-adị mma n'ahụ dozie oke shuga Nke mbụ, gbaara nri na mmanya nwere shuga ọsọ. Kama achịcha ọcha(white bread), na-eri nrị zuru oke. Shuga na nri eghere eghe ezụghị oke inye ezi ihe n'ahụ n'ihi na akwara(fibre) nakwa vitamin dị na ha emebiela. Iji maa atụ: Hapụ achịcha ọcha(white bread),eghere eghe osikapa ọcha, mmanya ọtọbịrịbịrị, ịhe ọṅụṅụ ụtụtụ ( breakfast cereals) nwere shuga. Kama hara nrị nwere akwụkwọ nrị, mkpụrụosisi, agwa na mkpụrụ nrị zuru oke. Ezi nrị ndị ọzọ gụnyere dịka mkpụrụ kashu, ọpapa, nakwa azụ nwere mmanụ omega-3 dịka azụ nwankata, azụ ahụekere (markerel) Ọ dị mkpa irichi nrị anya mana erifele afọ. Mmegharị ahụ dị mkpa na-ewetu shuga dị n'ọbara. National Health System (NHS) na-enye ndụmọdụ ka a na-enwe mmegharịa ahụ dịka ịgasi ije ike, ịrị ụlọelu, na egwuregwu ndị ọzọ awa abụọ na ọkara kwa izuụka. Ọ dị mkpa ka mmadụ na emegharị ahụ awa abụọ na ọkara izu ụka ọbụla." afirika-50457347,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50457347,Mauricio Pochettino: Tottenham esepụla ya oche n'otele,Akụkọ mere ugbua na-akọwa na Tottenham ejiri azịza zapụ Mauricio Pochettino chịkọtara ha afọ ise.,"Pochettino nọrọ afọ ise dịka onye nchịkọta/nkuzi Tottenham N'okwu ha depụtara iji gbasaa ozi ọchụchụ ya, Daniel Levy bụ onyeisioche klọb ahụ kwuru sị ""ọ rara anyị ahụ ime mgbanwe a. ""Ọ bụghị mkpebi anyị mere n'ọkụ ọkụ, kama ụdịrị ihe anyị gbatara na League na ngwụcha afọ gara aga na nke anyị na-agbata na mbido afọ ọhụrụ a agaghị ka anyị si chọọ"". EFCC na-enyo etu nwoke nọ na mkpọrọ si gwunwuo mmadụ nde dọla Otu nwoke nọ nga n'afọ 24 n'ụlọmkpọrọ Kirikiri dị na Legọs maka iji intanet gwuo chamdum anọrọla ebe ahụ mee nke ka nke. EFCC chọpụtara na Hope Olusegun Aroke menwụrụ nke a n'ihi na o nwere ohere ịnwe ekwenti na ịntanet nke onye nọ na mkpọrọ ekwesịghị inwe. Gịnị ka Uche Nwosu ga-eme ugbua? Nke na-akpọtụ ugbua bụ na ụlọikpe mkpegharị n'Abuja akụchapụla akwụkwọ Uche Nwosu nke Action Alliance gbara Emeka Ihedioha nke PDP maka mpụtara ntuliaka ha mere na Febuary. Uche Nwosu na Emeka Ihedioha chịpụrụ ya na ntụlịaka nke gọvanọ n'Imo steeti bụ nke Inec nyere Ihedioha mmeri. Nke a na-eme dịka akwụkwọ Ararume na Uzodinma gbara Ihedioha dara mmiri. Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke Jọstis Justice Oyebisi Omoyele nọ n'isi ya kpebiri ya bụ ikpe. Ndị a nille sị na Ihedioha enwetazughị vootu ikpo abụọ n'ụzọ atọ a chọrọ na steeti ahụ maka onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ. Nwosu, Ararume na Uzodinma rịọrọ ụlọikpe ka e wezụga mkpebi ụlọikpe ntụliaka bụ nke sị na Ihedioha meriri na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị nke afọ 2019. Ọzọ mere taa bụ na ụlọikpe ukwu n'Ikeja kpụpụtara Ogunyemi Olalekan ka ọ bịa zara ọnụ ya. Olalekan bụ onye uweojii ahụ a sị gbagburu nwokorobịa aha ya bụ Johnson Kolade na ọnwa maachị afọ a ebe ha na-ekiri bọọlụ na Mangoro, Legọs. Okpunnabụenyị adọkaala N'ofesi, ụzụ atụọla ka a chọpụtara na ụfọdụ okpunnabụenyi ndị otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ Marie Stopes kere na Uganda nwere oghere maọbụ nwee ike ịgbawa dịka ngalaba na-ahazi ọgwụ sị gbaa n'ama. Otu egwuregwu Edo erie ka bọsụ N'egwuregwu, Edo steeti akpụọla otu egwuregwu ụmụnwaanyị ha isi akpụrụ Albertị. Gọọmenti steeti ahụ ekwetala na ha ga-ebido ịkwụ ụmụnwaanyị ahụ ụgwọ, dịka akwụrụ otu egwubọọlụ ụmụnwoke Bendel Insurance. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọkụ gbagburu otu ezinaụlọ gụnyere mmadụ anọ n'ime abali Blessing Okafor hapụụ ụmụ ya atọ n'ime 'Container' gawa mkpa ya oge ọkụ gbara Ụzụ akwa na-atụ na Benue steeti ebe nwoke mmadụ aha ya bụ Seker Akaa, bụ onye odeeakwụkwọ ebighebi n'ụlọọrụ gọomentị, so nwunye ya bu afọ ime nakwa ụmụ ya abụọ were nwụọ n'ọkụ ahụ. Ndị ụweojii kwetara na otu ezianụlọ gụnyere mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba ebe ndị agbatobi kwuru na ndị ahụ ahụghị ụzọ ha ga-esi gbalahụ ọkụ ahụ mgbe ha tetara. Ndọrọndọrọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari agwaala ndị otu PDP na ndị ọzọ ha gbara gawa ụlọikpe maọbụrụ na mpụtara ntuliaka e mere na Kogi nakwa Bayelsa steeti edoghi ha anya. O kwuru nke a dịka Inec weliri aka Yahaya Bello dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi steeti. N'egwuregwu, Otu na-achịkọta ndị egwuregwu n'ụwa niile edegarala minista na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa akwụkwọ ozi ịkweta na ha enwetala dọlla otu narị puku na iri atọ bụ ụgwọ ha kwufere Naịjirịa mbụ. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49727191,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49727191,Economic Advisory Team: Ọ ginịdị ka Soludo ha ga na-arụ?,"Ka Onyeisiala Muhammadu Buhari hibere otu ga na-agba izu maka akụnaụba obodo Bekee kpọrọ ""Economic Advisory Council"" (EAC), ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe ga-abụ ọrụ ha.","EAC bụ nchịkọta ndị mmadụ kacha mara maka akụnaụba ga-arụ ọrụ dịka nke otu akpọrọ Economic Management Team (EMT) nke Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo nọbụ n'isi ha. Nhọpụta otu ọhụrụ a mere ka nke Osinbajo bụrụ ihe achọghịzị nke mere eji sị ha ""ga-anụ nke ọma"". Dịka gọọmentị siri kwuo, otu ọhụrụ a ga na-ezute Onyeisiala Buhari na ngwụcha ọnwa anọ niile, ma ha ga na-ezute onwe ha ọnwa niile. Ọkamụta Doyin Salami bu onyeisi otu a ka Dọkịnta Mohammed Sagagi bụ osote ya. Ọkamụta Ode Ojowu, Ọkamụta Chukwuma Soludo, Dọkịnta Shehu Yahaya na Iyabo Masha bụ ndị sokwa n'otu a. Kedu ọru otu a? Ọrụ otu a nke kachasị bụ inye gọọmentị ndụmọdụ maka mbulite akụnaụba Naịjirịa. Ha ga-enwe ntị Onyeisiala Buhari, nke bụ mgbanwe n'ihe e mere ka ọ malitere ọchịchị n'afọ 2015. Mgbe ahụ, ọ bụ Osote Onyeisiala Osinbajo ka a na-agwa okwu a. Bashir Ahmad bu otu n'ime ndị na-enyere Buhari aka kọwara mpụtara atụmatụ a na Twitter. Na Twitter Oby Ezekwesili na-akụrụ ndi a ahọputara aka ma na-enye ha ndụmọdụ ka ha gwa Onyeisiala Buhari ihe ọ si na ọ bụ eziokwu. Ndị nọ n'otu a Doyin Salami bụ ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụkwara onye nkuzi na mahadum ojiego achụ ego di na Legọs. Chukwuma Soludo bụ Ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụbụrụ onyeisi ụlọakụ ọha nke Bekee kpọrọ ""Central Bank of Nigeria"" site 2004 ruo 2009. Mohammed Sagagi na-arụ ọrụ metụtara ihe Bekee kpọrọ ""Political Economy and Conflict Analysis Manager"" na MAFITA. Sagagi bụbụ Ọkamụta na ihe banyere akụnaụba ma rụọ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrọ akpọrọ ""Jigawa State Investment Promotion Agency (InvestJigawa)"". Bismark Rewane bụ onyeisi ọlụọrụ akpọrọ ""Financial Derivatives Company Limited"". Ọrụọla ọrụ ihe ruru afọ iri atọ na ngalaba metụtara ụlọakụ, akụnaụba na ego. Ode Ojowu bụ ọkamụta na ihe banyere akụnaụba ma bụbụrụ onye ndụmọdụ Olusegun Obasanjo site 2004 ruo 2005. Shehu Yahaya bụ Ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụrụ onyeisi ndị nhazi ""Development Bank of Nigeria Plc"" Iyabo Masha bụ onye na-anọchite ngalaba akpọrọ ""International Monetary Fund"" (IMF) na mba Sierra Leone. Akụkọ ga-amasị gị Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere" afirika-51733044,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51733044,Africa's Top Economy: Naijịrịa o kwesiri ịbụ mba akụnaụba ya kachasị n'Afrịka?,Naijirịa alaghachila dịka mba kacha nwee akụnaụba n'Afrịka.,"Dịka akụkọ na-ewu, kedu ihe nke a pụtara? BBC jụrụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ kachasị na Naijirịa (CBN) bụ Isaac Okorafor ka ọ kọwatụrụ anyị ihe nke a pụtara. Okorafor kwuru sị na Naijirịa kwesiri ị bụ mba akụnaụba ha kachasị n'Afrịka kama ọ bụ etu ụfọdụ ihe siri mee mere ka Naijirịa ji gbada. O kwuru na ọ bụ ọtanisi dị na Saut Afrịka mere ka Naijirịa ji lọghachị dịka onye mbụ maka akụnụba n'Afrịka. O kwukwara sị na obi adịghị Naijirịa mma na Saut Afrịka abanyela ""Recession"" kama ọ na-egosi na ndị Naijirịa rusie ọrụ ike na Naijirịa ga-akawanye mma. Dịka o sị kwuo ""Ihe dị mkpa ụgbua bụ ka ndị Naijirịa gbasie mbo ike nke ga-eme ka akụnụba Naijirịa sie ike ma agbagote"". Okorafọ kwuru na CBN nwere atụmatụ ha ji akwalite ndị ọrụ na arụpụta ihe dị iche iche ga-ebulite akụnaụba Naijirịa. Atụmatụ a nke ha kpọrọ ""PAVE"" (Produce, Add value and Export) ga-enyere ndị na-arụ ọrụ ubi na ndị na-arụpụta ihe aka. Etu ọkammụta maka Akụnaụba ụwa sị kọwaa ya Ndị ọrụ aja na Legọs Ọkanmụta n'ihe gbasara akụnaụba mba bụ Uche Ụwaleke kwuru sị na ị bụ onye nke mbụ n'Afrịka maka akụnaụba bụ maka ihe a kpọrọ GDP. Uwaleke kọwara na GDP bụ nchịkọta ịchụ ego na nrụpụta n'otu ebe. Ọ kọwara na Naijirịa ị bụ mba kacha nwee akụnụba n'Afrịka bụ maka na Naijirịa nwere ọtụtụ mmadụ. O kwukwara sị ""ihe kacha dị mkpa bụ etu ndị mmadụ si ebi, ahuike, ụlọ obibi, agụmakwụkwọ, ị nwe ọkụ latrik na ezigbo mmiri ọṅụṅụ kacha mkpa karịa nnụkwụ GDP."" Uwaleke sị kwa na mba Saụt Afrịka nwere ike ịpụta na ọtanisi ọsịsọ karịa Naijirịa n'ihi na ha nwere ihe eji edozi obodo karịa Naijirịa. O kwukwara sị' ""enweghị nchekwa na-eme ka Naijirịa hara irite elele dịka mba kacha nwe akụnụba n'afrịka"". Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48110213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48110213,Ihe gọọmentị kwesiri ịme iji gbalahụ 'Recession',Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo bụ Okechukwu Okere adụọla gọọmnetị etiti ndụmọdụ.,"O kọwara na gọvanọ ndị steeti na-eti mkpu nwere ikike iti ya bụ mkpu. Ọ sị na ọ bụ maka na ọtụtụ ihe metụtara ọchịchị na akụnaụba obodo adabanyeghị. Gịnị bụzị usoro ga-agbanwe ihe? Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi Okere kọwara na gọọmentị etiti kwesiri ime Naịjirịa ka ọ bụrụ obodo ebe azụmahịa dị mfe site na Restructuiring. Nke a pụtara na steeti dị icheiche agaghị atụkwasị anya n'ego gọọmentị etiti na-enye ha. Ya mere na steeti dị icheiche kwesiri ịkwalite akụnaụba obodo nke ha. O kwukwara na e kwesiri ịnwe mkparịtaụka n'etiti gọọmentị na steeti ndị a iji chọpụta ụzọ ha ga-esi mezuo ya bụ ihe. Na ngwụcha, o kwuru na inye steeti ndị a enyemaka bụ ihe ga-eme ka ha kwuru n'onwe ha n'oge adịghị anya." afirika-47616017,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47616017,Nigerian pastors: Ụkọchukwu ndị 'na-eti eti' n'ọwụwa-anyanwụ,"Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na Naịjirịa bụ ndị a na-ahụta dịka ndị ""ma nke ha riri"" ma a bịa n'ịta akụnaụba.","Ndị ụkọchukwu a, ganye ndị nke ụlọụka ha dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, bụ ndị hibere ụlọụka nke ha, ma nwee ọtụtụ ndị na-abịa efe ofufe ebe ahụ. Ọtụtụ ndị na-aga n'ụlọụka ha bụ ndị ọ ga-abụ a sị ha ""wụlie elu"" ha asị ""kedụ ogo ị chọrọ ka anyị wụruo?"" Nke a kpatara ọtụtụ ndị mmadụ si eche na ndị a na-aga ụka ha anaghị ahụ ihe ọjọọ ọbụla n'ime ibunye ndị ụkọchukwu a ego ọbụla ha nwere ka ha na-ebi ndị ọma, ebe ha na-ata ahụhụ. Lee ụfọdụ n'ime ndị ụkọchukwu ahụ na etu ha si wuo maka ịta akụ. 1) Intercessor Jehovah: Onye a bụ onye amụma na-ewu ewu n'Aba, Abịa steeti maka ihe ọ na-eme n'ụlọụka ya bụ ""Holy Ghost searchlight and deliverance ministry"". E ji onye na-ebibi mmụọ ọjọọ a kpọrọ ""demon destroyer"" mara ya. Ọ bụ otu nwoke ma ka e si ata akụ n'ụzọ gụnyere ịzụ ụgbọala bụ ""elelebe ejeghi ọrụ"", dịka ndị ụlọụka ya tinyere na soshal midia, nke ọ zụrụ ọhụrụ n'ọnwa Maachị a mere ya Hummer Limousine stretch nke atọ ọ na-azụta. 2) Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere: Onye amụma a ama dịka Odumejeje, bụ onye hibere ụlọụka ọ kpọrọ ""Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry"", dị n'Ọnicha, Anambara steeti. Ọ bụ otu onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ maka etu o si agbasa aka n'ihe banyere akụnaụba. Ụfọdụ oge ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọnye ego n'elu ọdọmmiri, oge ọzọ ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọ otu onye Nollywood ego. 3) Onye amụma Ebelenna Chukwu Ebelenna bụ onye ọzọ na-ewu ewu n'ala Ọnịcha, Anambara steeti. Ọ bụ onye hibere ụlọụka a ma dịka ""Jehovah The Mightier Than All Prophetic Church"". A hụla ya n'ihe nkiri ebe ọ nọ na-efe nnukwu ego ka otu onye ụlọụka ya na-agba nkwụ. N'ihe onyonyo ahụ, otu onye bu akpati ego na-esogharị ya ka ọ na-abọ ya bụ ego." egwuregwu-54220658,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-54220658,Man United vs Crystal Palace: A dụpuola Man Utd ka blomblom,"Na-erughi otu afọ ha nyakasịrị Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ, Crystal Palace emekwaala ya ọzọ.","Ndị Manchester United tiri okokoko dịka ndị Crystal Palace dọkasịrị ha n'Old Trafford, n'ihe bụ asọmpi mbụ ha na-agba n'afọ 2020/2021 a. Ndọkasịrị a mere ndị Man Utd echeta ebewe dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a sara otu merie ha n'ihu Sir Alex Ferguson bụ chịkọtaburu ha. Wilfred Zaha ji ibu kara aka gbakaa neetị na nkeji 74 dịka igwe nnyocha Video Assistant Referee (VAR) kwuru na David De Gea akwụghị n'akara ya oge Jordan Ayew gbanyere ya penariti nke mbụ n'aka. Nke a bụ tupu o mezuo ya goolu atọ nke ndị Crystal Palace na-enye na nkeji 85. Donny Van de Beek zara aha nna ya ozugbo, na-erughi nkeji 15 ọ batara n'ihe bụ bọọlụ mbụ ọ na-agbara Man Utd na Premier League. Andros Townsend bu ụzọ mepeere ndị Crystal Palace ahịa dịka ọ dọkara neetị na nkeji asaa e jiri bido bọọlụ. Man Utd ga-ezute Luton Town n'asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị 22 nke ọnwa Septemba a, tupu ha ezutekwa Brighton n'ụbọchị 26 nke Septemba." afirika-50913563,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50913563,Child Abuse: Ndị uweojii enyeghachila nwa a pịara n'ala ndị mụrụ ya,Obere nwatakịrị nwaanyị ahụ dị afọ asatọ bụ Peace Goewan nke nne ya ukwu buliri ka ndị na akụ ọkpọ were kụọ ya ukwu na-ala abụrụla onye ndị uwe ojii nyefere n'aka nne na nna mụrụ ya.,"Nna peace bụ Nicodemus Goewan na nwunye bụ Jane kwuru na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ Jonathan Goewan ka ya dunyere nwa ya n'ihi nkwa o kwere na ya ga azụ ya n'ụlọakwụkwọ. Ọ kwara arịrị na mmegbu nwa ya gabigara na-aka nne ya ukwu bụ Amaka Otolehi ma kelee Chukwu na nwa dị ndụ. Nne nwata ahụ kwuru na ọ bụ ihe isi ike mere ya jiri kponye nwanne di ya nwa ya. Cheta na ihe onyonyo na-ata anya arụ nke gosiri nwaanyị ebe ọ pịara nwatakịị n'ala wuru na soshal midia izuụka ole ma ole gara aga. Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Ahmad Abdulrahman gwara ndị ntaakụkọ nke a ma gosi na ọ hanyela nne na nna nwa ahụ n'aka ha. Abdulrahman kwuru na ịtụ mgbere nwa ma ọ bụ iji nwa mmadụ mere ohu megidere iwu obodo Naịjirịa. Ọ dọrọ aka na ntị na onye ọbụla aka ya dị na ya bụ ihe ga-enweta ntaramaahụhụ dịka iwu si dị. O kwuru na ndị uweojii n'Enugwu akpụpụla nwaanyị ahụ bụ Amaka Otolehi n'ụlọikpe tinyere ndị niile aka ha dị na ya bụ iji ụmụaka eme ohu ma ọ bụ ịtụ mgbere mmadụ. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị pịara nwaodibọ ya n'ala Nwaanyị pịara nwaodibo ya isi n'ala akwaala arịrị ma rịọ ka a gbaghara ya. Nwaanyị ahụ aha ya bụ Amaka Otolehi kwuru na ọ bụ iwe ọkụ tinyere ya n'ọnwụnwa. Aka ndị uweojii kpaara nwaanyị ahụ oge ihe onyonyoo ebe ọ na-akụ nwata ahụ a kpọrọ 'Peace' ihe gbasara na soshal midia. Iwe juru ọtụtụ ndị mmadụ afọ oge ya bụ ihe onyonyoo gbasara. Mana n'ihe onyonyo ọzọ nke gosiri ebe ndị uweojii na-agba nwaanyị ahụ ajụjụ, o kwuru na ya abụghị ajọ mmadụ. ""Mụ na Peace ebiela ihe karịrị afọ abụọ, ọbụghị etu a ka m si emeso ya."" ""A hụrụ m ụmụaka n'anya nke ukwu. A na m eme Peace ka nwa m."" ""Ọ bụ oke iwe mere m ji kpaa ụdị agwa ahụ. Biko gbagharanụ m."" Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmad Abdulrahman, kwuru na ha na-enyocha okwu ahụ ebe ha ga kpụpụ nwaanyị ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nke a. Ọ gara n'ihu kwuo ha ga na-elekọta nwata ahụ ganye oge ha ga-enyefe ya n'aka ụlọrụ gọọmenti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi" afirika-51421110,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51421110,"Donald Trump, Fada Ejike Mbaka, uwe ọhụrụ ndị Super Eagles na ihe ndị ọzọ wuru n'izu a","Izuụka a malitere n'ụbọchị abụọ ma kwụsị n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020, nwere ihe e ji kpọọ ya 'ọpụrụiche'.","Ihe ndị mere na ya bụ izu gụnyere akụkọ ndọrọndọrọ, egwuregwu, ịkpaọchị dgz, na Naịjirịa nakwa ụwa niile gbaa gburugburu. Ụfọdụ akụkọ ndị a gụnyere; Emeka Ihedioha na Fada Ejike Mbaka N'izuụka a, BBC Igbo gbara Emeka Ihedioha ajụjụ banyere ihe mere o ji alaghachị n'ụlọikpe kachasị kamgbe ha chụturu ya dịka gọvanọ Imo Steeti. Na nzaghachi, Ihedioha sị na ọ bụ n'ihi na ya na ndị ọkaiwu ya chọpụtara na ikpe ahụ ụlọikpe a kpere edochaghị anya. Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị Tinyekwara na ha nwere ohere ịlaghachị azụ ka ụlọikpe tulegharịa ikpe ahụ. Mkparịtaụka a butere ọtụtụ okwu na soshal midia. Imo state: ""Ihedioha nwere ike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya"" - Mbaka Na nke yiri ibe ya, ụkọchụkwụ 'Adoration Ministry Enugwu' bụ Fada Ejike Mbaka kwuru ihe wuru ewu n'izu a. O kwuru na ọ bụrụ na Ihedioha akapcharaghị anya, na ọ ga-aga mkpọrọ n'ihi etu o si achụso ikpe nchụtu ya. Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị N'izuụka a ka ụlọorụ ekwentị kwuputara na ha ga-amalite ịna pasentị asaa na ụma ise dịka ụtụisi ịkpọ oku nakwa izipu ozi n'ekwentị. Ọ malitere iwu na soshal midia Twitter, ebe ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa. Iji maa atụ, ozi 'sms' a na-anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT. Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Jenụwarị. Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'Value Added Tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise. Aka Donald Trump dị ọcha N'ụbọchị Wenezde nke izu a, ndịomeiwu mba Amerịka mere ntuliaka ma kwuo na aka onyeisiala ha bụ Donald Trump dị ọcha n'ebubo abụọ e boro ya. Ndị ụlọomeiwu nta mba Amerịka boro Trump ebubo na ọ na-emebi ikike ọchichị ya nakwa ụlọomeiwu n'ọnwa Disemba 2019. Mana ndị Sịnetị kụchapụrụ ebubo ndị a ma kwuo na o nweghi iwu ọbụla Trump dara. Nke a mere ya onyeisiala mba Amerịka nke atọ e boro ebubo nchutu n'ọchịchị. Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 N'ụbọchị Tọzde n'izu a ka onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu weturu ọnụọgụgụ pati nọ Naịjirịa site n'iri itoolu ruo iri na asatọ. Nke a mere oke mkpọtụ na Naịjirịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ụlọọrụ Inec n'ọnụ. Mmachi keke na ọgbatumtum na Legọs N'ụbọchị Monde izu a, ndịọrụ Bekee na ndịọrụ dị icheiche bi na Legọs takutere ya kọnkịrị dịka ha na-aga ọrụ ka e zuchara ike ngwụcha izu. Nke a bụ maka mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na okada nke malitere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020. Keke Ban: A napụla anyị na ụmụ anyị nri n'ọnụ Ngwa ka anyị nabata gị n'ọgbọ egwuregwu na obi aṅụrị ebe a; Abụ m nwaafọ Naịjirịa - Lil Wayne N'otu izu a ka nwaafọ Amerịka na-eti egwu bụ Lil Wayne kwupụtara na ọ bụ nwaafọ Naịjirịa nke butekwara ọtụtụ okwu n'etiti ndị Naịjirịa. Mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ, Lil Wayne sị na o mere nyocha ahụ ma chọpụta na o ji pasentị 53 bụrụ nwaafọ Naịjirịa. O kwuru na ya na nne ya nwere ezigbo mkparịtaụka gbasara nke ahụ. Uwe bọọlụ ohụrụ nke Naịjirịa N'ụbọchị ise nke ọnwa Febụwarị a ka otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation(NFF) wepụtara uwe ọhụrụ a ga na-eji agba bọọlụ. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa katọrọ uwe a ma kwuo na nke a bụ mkparị nye Naịjirịa ebe ndị ọzọ katọrọ ndị e ji gosi uwe a. Ị lezie anya ị ga-ahụ na akụkọ ndị a na ndị ọzọ na-anọghị ebe a mere ka izuụka a bụrụ 'ọpụrụiche' na nke onwe ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43468720,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43468720,Anwụrụ ọkụ achụpụla ndị mmadụ na gburugburu ha na Lagos,Ọkụ na-agba n'ime ebe a na-awụfụ ahịhịa a kpọrọ Olushosun na Lagos Steetị eme la ka ndị mmadụ gba ọsọ.,"Ebe a na-awụfụ ahịhịa n'Olushosun Mgbe BBC Igbo gara ebe ahu ụnyaahụ, ha chọpụtara na ndị mmadụ bi gburugburu ebe ahụ nwere ike ịpụ akwapụsịala, ọkachasi ndị bi na Bello Folawiyo Cresent, bụ ebe dị na nkpọda ebe a na-awụfụ ahịhịa. 'Aga m akwapụ ta!'. Ndị mmadụ na-agba ọsọ na be ha Ndị BBC Igbo gbara ajụjụọnu ebe ahu kwuru na ha amaghị ihe ha ga-eme maka na anwụrụ na-ekupụta site n'Olushosun bụ ezigbo nsogbu nye ha. Ndị mmadu tiri mkpu ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka. Sọ ndị nọzị na ụfọdụ ụlọ bu ndị nchekwa Ihe ọzọ mere ihe jiri dikarịa njo bụ na ụlọakwụkwọ na ụlọụka gbara Folawiyo Cresent okirikiri. Na mbata ya, ị ga-ahụ Ikosi High School, Ikosi Primary School, ụlọụka Anglican, ụlọakwụkwọ ndị nkịtị, ahịa Jakande nakwa ebe dị icheiche ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakọ. Onyeisi ndị nkụzị n'Ikosi High School ekweghi ka anyi gba ya ajụjụọnụ maọbu sete foto n'ụlọakwụkwọ ya maka na ha sị na ha achoghị nsogbu gọọmentị. Mana onyeisi ndi nkuzi ụlọakwụkwọ na-abụghị gọọmentị nwe gwara anyị na nke a bụ mbụ ha na-ahụ ụdịrị ihe a. Ha kwukwara na ha kara ịgbachi ulọakwụkwọ ha, mana ụmụakwụkwọ na-eme ụle. Ha kwuru na ha na-agbachị ụlọakwụkwọ n'oge, ma na enye ụmụaka ha ihe eji emechi imi. Ọfọdụ ndị mmadu BBC Igbo hụru n'ụzọ yikwa ihe eji agbachi imi. Ọkụ Olushosun agbaala izuuka abụọ BBC Igbo gakwara gba onyeisi ngalaba gọọmentị na-ahu maka gbụrụgbụrụ na Lagos Steeti bụ Babatunde Durosinmi Etti ajụjuọnụ maka ihe a na-eme, o kwuru na ha na-agba mbọ ịhụ na a gbanyụrụ ọkụ a. Ọ gakwara n'ihu sị na ha na-akwado ka ndị mmadụ kwapụ na gburụgbụrụ ebe ihe a mere. Cheta na ndị ọrụ na ahu maka gbụrụgbụrụ na Lagos Steetị wakporo onye ntaakụko BBC ebe ọ nọ na-achu nta akụkọ. Maazi Etti riọrọ ndị BBC ezigbote arịrịo maka nke, sikwa na ha ga eme nyocha maka ihe mere, makana ọgbughi etu ndi ọrụ ha siri eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43770027,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43770027,Manchester City eburula iko Premia Lig,Eze ọchị wara Pep Guardiola tata mgbe Manchester City tukwu n'ụlọ be ya mgbe chi ha bunyere ha iko Premia Lig.,"Man City a nọrọla na be ha buo Iko Premịa Lig taa Ilu ndị Igbo na-atu sị na ""Osisi kpọrọ nkụ a na-atụ anya ọdịda, nke dị ndụ buru ya ụzọ daa"" bịara na nmezụ taa n'aka ndị West Brom na Manchester United. Ọ bụ ihe ịtụnanya mgbe otu egwu bọọlụ West Brom meriri Manchester United be ha tata. Mmeri a mere ka Man U na-agbabu ndị nke abuo were pọint iri na isii dachie azụ nke bụ na ha merigodi asọmpi ise ha nwere n'ihu, ha agaghị esi iko Premia Lig imi. Nke a bụ ugboro atọ ndị Man City na esusu iko Premia Lig ọnụ na ugboro asaa ha zọgoro ya bụ iko. Ha gosiri ọkaibe site na ịnye goolu 93 ebe emeriri ha nanị ugboro abuo. Nke a bụ iko iri abuo na anọ (24) Pep Guardiola bụbu onye nkuzi ndị Barcelona na Bayern Munich ritegoro kemgbe o bidoro kuziwa bọọlụ. Ya bụ nwa amadị gbara afọ iri anọ na asaa (47) ebubola iko lig na Spen, Jamani nakwa Champịọns lig ugboro abuo bu nke ya na Barcelona butere. Kemgbe Sheikh Mansour bin Zayed Al Nahyan gooro otu bọọla Man City, ha ebutela iko asaa chara anya, tinyere iko FA nakwa nke FA Community Shield. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Akpụpụla onye ọcha 'gburu ndi be ya' nga Akụkọ kachasị n'abalịa a: Man City bụ ọkaibe" afirika-50655767,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50655767,Mama Boko Haram: EFCC akpụpụla Aisha Wakil ụlọikpe,EFCC na-ebo Aisha Wakil ebubo mpụ ego ruru nde naịra iri isii na isii n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde na Borno steeti.,"Onye ọzọ a na-atụ aka na o so kpaa mkpa mkpa a bụ Tahiru Saidu Daura. Okwu ha bidoro mgbe otu nwoke a kpọrọ Ali Tijjani kwuru na ha gwara ya bunye ha nrị ọka akpọrọ 'Biski' ha jụrụ ịkwụ ya. Ụlọikpe nyere ha ohere ịgbapụta onwe ha n'ọnụ nde naịra iri atọ ma sị ha bịaghachi n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020. Gaasị agbaala na Legọs Ebe a na-ere okpokoro gaasị Mmadụ atọ merụrụ nnukwu ahụ oge udu gaasị gbara n'ike n'ogige ụlọoriri na nkwari dị na Victoria Island na Legọs. Aha ya bụ ụlọ oriri na nkwari bụ Four Point by Sheraton. Dịka ndị 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA) si kwuo, ndị ọrụ ji gas agbado ihe ọkụ mgbe ya bụ ihe mere. Eburula ndị ahụ merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ dị na Lagos Island. Jose Mourinho ọ ga-ahụ nke tọrọ fada n'Old Trafford taa? Nke a ga-abụ mbụ Mourinho na Ole Gunna Solskjaer ga-ezute kemgbe ọ malitere ịchịkọta Tottenham Jose Mourinho ga-ahụ ma ọ ka bụ anụ kpọrọ nkụ na-eju ọnụ mgbe Tottenham na Manchester United ga-ezute taa. Asọmpi a ga-esu n'ọgbọegwuregwu Old Trafford bụ ebe Mourinho chịkọtara Man Utd afọ abụọ na ụma. Mourinho emeriela egwuregwu atọ Tottenham gbarala kemgbe o werela ọchịchị n'ụbọchị Nọvemba 20, 2019. Ebe ụkwụ na-ama Solskjaer na onwe ya riririri ka o nwetara onye lawa onye lawa abụọ, e merie ya n'otu n'ime egwuregwu atọ ọ gbarala nso nso a. Liverpool ji akara iri abụọ na isii agafe Everton na tebulu EPL N'asọmpi ndị ọzọ a ga-enwe n'abalị Wenezdee, Liverpool ga-ezute Everton. Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ asọmpi a ka a ga-eji mara ma onye nkuzi ndị Everton bụ Marco Silva ọ ga-anọ n'ọrụ ka ọ ga-akwara laa. Chelsea ga-ezute Aston Villa, Leicester ga-ezute Watford ebe Wolves ga-ezute West Ham. Gbọọnụ ụgwọ unu riri Ụlọikpe etiti enyela otu a kpọrọ SERAP iwu sị ka ndị niile bụ sinetọ na mịnịsta chịburu dịka gọvanọ mana ka na-eri ụgwọ ezumiike nka, gbọọ nke ha riburu. Ya bụ iwu nyekwara onye ji akpaego Naịjirịa ikike ịgba ha akwụkwọ ka ha kwuo ebe ha si enweta ikike ha ji eri ya bụ ụgwọ. Germany achụọla ndị nnọchite anya Russia na be ha Ndị uweojii na-eme nnyocha n'ogige ebe a gbagburuat the spot in a Berlin park where the Chechen exile was shot dead Mba Germany achụọla mmadụ abụọ na-anọchite anya mba Rọshịa n'obodo ha. Nke a bụ maka ebubo ha na-ebo na Rọshịa ma maka mgbagbu a gbagburu otu nwoke onye Chechen na Berlin n'ọnwa Ọgọst afọ a. Chechen bụ obodo si na Rọshịa wee nwere onwe ha n'afo 1993. Nweta TIN gị tupu ị were ego n'ụlọakụ - Ahmed Minista na-ahụ maka akụnaụba obodo bụ Zainab Ahmed, ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịdọrọ ego ya n'ụlọakụ na-enweghi ihe Bekee kpọrọ Tax Identification Number site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020, jiri nwayọ dụọ azụ. Mmiri eburula onye gara ịzọ mmadụ Nne Ann Nduku kwuru na nwa ya gaara abụ ezigbo onye ọchịchị ma ọ bụrụ na mmiri erighi ya Ihe mgbawa obi mere ebe nwaagbọghọ chọrọ ịzọpụta otu nwoke ka idemmiri na-achọ iburu ya na mba Kenya, tụnyere ndụ ya. Nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Ann Nduku dị naanị afọ iri na itoolu, dabara n'iyi Kandisi dị n'obodo Ongata Rongai, dị nso isiobodo Nairobi, n'ụbọchị Tuusde, ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba. Nwoke ọ gara ịzọ anwụghị, mana mmiri buru Nduku eleghi anya n'azụ. Nne ya bụ Elizabeth Mutuku, nọ ebe ahụ ma hụ ka mmiri na-ebu nwa ya, kwuru na mbọ ọ gbara inyere ya aka lara n'iyi. A gbaala ndị 'oji mgbọ' na WAEC ama Ọ bụrụ na ị sọ na ndị 'ji mgbọ' lee ule ' West African Examinations Council' WAEC 1992/1993, asambodo gị efuola ọhịa o. Ụlọọrụ Jamb depụtara aha ndị ha sị gbara ya bụ mgbọ n'afọ ahụ, ma kwuo na ọ bụ mmerụaka a mere ha ji sie ọnwụ ka ndị niile ga-agbata akwụkwọ ule ahụ site n'afọ a, jiri akara njirimara ndị nwaamala Naịjriịa. Ihe gọọmentị Naịjirịa nwere ikwu maka mwakpo ndị Naịjiria na Ghana Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche ngalaba na-anọchite anya ndị Naịjirịa bi n'ofesi akatọọla mwakpo a malitere iwakpo ndị Naịjirịa bi na Ghana. Abike gara n'ihu rịọ ndị Naịjirịa ọkachasị ndị a gbachiri ụlọahịa ha ma sị na iwe ewela ha, ma rịọ ndị ọrụ nchekwa mba ahụ ka ha gbaa mbọ chekwaa ndị mmadụ na ngwongwo ha. N'ofesi, Ndị ụlọomeiwu mba Amerịka emeela iwu imegide ihe ha kpọrọ nwụchi na mmegbu ndị ekpere Alakụba Uighur, na mba Chaịna. Ka ọ dị ugbua, Gọọmentị Chaịna ekwuola na ọ bụ obi ọjọọ mere Amerịka ji ekwutọ ha n'ụdị a. N'egwuregwu, Man City ji iwe were goolu anọ a satara naanị otu gbajuo Burnley afọ ka ha zutere na Premier League n'abalị Tuusde. Cheta na ha na Newcastle gbara onye lawa onye lawa n'izu gara aga. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha" egwuregwu-49909204,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49909204,UEFA Champions League: Liverpool na Chelsea esitela mmeri n'ọnwụ,Agba ekperechi ka otu egwu bọọlụ Liverpool nke mba Ịngland ji merie ndị RB Salsburg nke mba Austria.,"Obere ihe ka ọ fọdụrụ ka ndị Liverpool nọrọ na mmiri ncha abaa ha anya. Ha jibu ọkpụ goolu atọ emeri na asọmpi ahụ. Ndị nyeere Liverpool goolu bụ Sadio Mane, Andrew Robertson na Sala. Mana ndị Salsburg mechara sachaa goolu ahụ niile. Na nkeji 69 ka Sala nyekwara goolu ọzọ iji mee ka ndị otu ya turu ugo. Victor Osimhen nyere goolu ndị Lille N'otu aka ahụ kwa, ndị otu egwu bọọlụ Chelsea ji ịta ikikiri eze wee merie ndị Lille nke mba Fransị. Ọkpụ goolu abụọ asatara otu ka Chelse ji turu ugo. Ụmụafọ Naịjiria abụọ nyere goolu n'asọmpi ahụ. Victor Osimhen nyere goolu nke ndị Lille ebe Tammy Abraham nyere nke ndị Chelsea. Willian bụ onye nyere goolu nke abụọ wee nye Chelsea mmeri. Abraham bụ nwaafọ Naịjiria mana ọgbabeghịrị Naịjiria bọọlụ mbụ. A na-atụ anya na ọbụ mba Ịngland ka o nwere ike ịgbara. Luis Suarez nyeere ndị Barcelona goolu abụọ Otu egwu Barcelona jisikwa ike merie ndị Inter Milan na be ha n'ụbọchị Wenezde. Ha jikwa ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee merie. N'asọmpị ndị ọzọ, Lyon meriri Leipzig 2-1, Dortmund meriri Slavia Prague 2-0. Napoli na KRC Genk gbara 0-0, ebe Ajax meriri Valencia 3-0. Ka ọ dị ugbua, Liverpool enwetala akara atọ maka ebe Chelsea nwere naanị otu akara. Cheta na ndị Napoli meriri Liverpool n'asọmpi Champiọns league nke mbụ nke afọ 2019/2020. Valencia jikwa otu ọkpụ goolu merie Chelsea n'oge gara aga. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?" afirika-51705949,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51705949,Enugu LGA Elections: Ihe mere PDP ji zakọrọcha ọkwa na ntuliaka e mere n'Enugwu Steeti,Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu steeti bụ Enugu State Independent Electorial Commission (ENSIEC) ekwuola na ọ bụ pati People's Democratic Party (PDP) meriri na ntuliaka niile e mere na Satọde bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Febụwarị.,"Ebe a na-atụ vootu na Amaorji Agbanyeghi na ntuliaka a gara n'udo dịka BBC hụrụ n'anya, otu n'ime mmadụ abụọ n'azọ ọkwa onyeisi pati All Progressives Congress (APC) na steeti ahụ bụ Okey Ogbodo gwara BBC na pati ha esoghi na ntuliaka ahụ. N'iza ajụjụ maka ndị APC aha ha dị n'akwụkwọ ntuliaka, Maazị Ogbonna sị na ndị a abughị ndị APC. Ọ sị; ""Ndị ahụ bụ ndị APC n'ehihe ma bụrụ PDP n'abalị."" Ogbonna gara n'ihu kwuo na ntuliaka ahụ adabaghị makana ọ bụghị oge e kwesiri ime ya ka e mere ya. N'okwu ya, Ogbonna sị na ọ bụ mgbe oge ndị ọchịchị gwụrụ n'afọ 2019 ka ndi ọhụrụ kwesịrị irigoro n'ọkwa. ""Ndị PDP were ndị ha kpọrọ ""Transition Commitee Chairmen"" tinye n'ọkwa. Iwu obodo megidere nke a"" Ọ sị na ọ bụ nke a mere pati ya jiri gbajụọ isonye mee ntuliaka. Dọkịnta Uzochukwu so na ndị seputere isi na PDP n'Enugwu Ihe ndị PDP na-ekwu Dọkịnta Uche Uzochukwu so na ndị isi PDP n'okpuru ọchịchi Ọgwụ gwara BBC na ya amaghi ihe onye APC na-ekwu makana etu ya si hụ ntuliaka ahụ, o gara nke ọma. Ọ sị, ""Na Nkwe be anyị, ebe m nọ tụọ vootu, ndị mmadu pụtara n'igwe bịa kwado PDP. Ndị APC pụtara enweteghi otu vootu."" Dọkịnta Uzochukwu sị na ọ bụ makana PDP na-eme ọfụma mere ndị mmadụ ji akwado ha nke ukwuu n'Enugwu. Onye na-anọchite mpaghara Ọgwụ n'ụlọomeiwu nke Enugwu steeti bụ Johnson Chukwuobasi kwenyekwara n'ihi Dọkịnta Uzochukwu kwuru. Omeiwu Chukwuobasi sị, ""O nwere onye be anyị, onye Mmaku, so zọọ ọchịchị n'aha APC, ọ chịtaghị aja maka na ọ bụ PDP ka ndị ebe anyị na-akwado."" Ntuliaka Amalitela na Nkwe di n'okpuru ọchịchi Ọgwụ 'Ihe mere PDP ji merie ebe niile' Dọkịnta Uzochukwu sị na aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na-eme ọfụma nke mere ndị mmadụ ji sị ka PDP chịrị gawa. Ọ sị, ""Agaghị m asị na ọ bụ makana APC anaghị achịta na gọọmentị etiti mere ka ndị mmadụ na-akwado PDP, makana steeti dị iche iche. Nke bu eziokwu bụ na PDP na-eme ọfụma n'Enugwu site na gọọmenti Ifeanyi Ugwuanyi."" Omeiwu Chukwuobasi rụtụrụ aka n'usoro Bekee kpọrọ zoning, bụ atụmatụ PDP na-eso n'Enugwu, dịka otu ihe mere ndị mmadụ jiri akwado patị ahụ. Ọ sị, ""Zoning na-enye aka. Dịka ugbua, onye meriri ịbụ onyeisi ọchịchị ime obodo bụ onye Ọgwụ, onye rituru n'ọkwa bụkwa onye mpaghara ọzọ. Etu a ka e si eme ya."" Atụmatụ ""zoning"" a malitere n'Enugwu kamgbe Chimaroke Nnamani bụ gọvanọ steeti ahụ. Ya bụ atụmatụ metụtakwara etu e si a họpụta ndị ọchịchi Bekee kpọrọ ""Councillor"" Ebe APC kwụ Okey Ogbonna na-ekwusi ike na aka pati ya adịghị na ntuliaka ahụ, ma na-ekwukwa na ya nwere olileanya na ndịisi pati ha no n'Abuja ga-aghọta na ọ bụ ya ka ""ụlọikpe kpebiri dịka onyeisi APC n'Enugwu kpọmkwem.""" 42829748,https://www.bbc.com/igbo/42829748,Ndị ntaakụkọ ụmụnwoke 4 na BBC ekwenyela ka achabie ụgwọọrụ ha,Ụmunwoke anọ bụ ndị ntaakụkọ BBC ekwenyela ka achabie ụgwọ ọrụ ha site na nyocha emere gbasara ndịche dị n'ụgwọọrụ.,"Site na-aka nri elu-Jeremy Vine, John Humphry, Jon Sopel na Huw Edwards kwenyere na nchabi ụgwọ ọrụ ha Ndị a bụ Jeremy Vine, John Humphrys, Huw Edwards na Jon Sopel ekwenyela n'usoro ma ọ bụ odoro anya ka ewetụlata ụgwọọrụ ha. Nke a soro arụkwaghịm n'ọrụ nke Carrie Grace gbara n'ọkwa ya dịka onye editọ ụlọ ọrụ BBC nke mba China, iji gosipụta iwe ya na ndịche n'ụgwọ ọrụ ndị editọ nwoke na Nwanyị. Aga ewepụta akwụkwọ nyocha ndiiche n'ụgwọ ọrụ nke BBC n'ịzụka ọzọ na-abịa abịa. Mgbe emere nyocha gbasara egoole BBC na-akwụ ndị ọrụ ya na-agụpụta ntaakụkọ nke karịrị puku pounds otu narị na iri ise Aha Chris Evans, Sopel, Jeremy Bowen so na-akwụkwọ ahụ ebe aha Gracie na Katya Adler anọghị na ya bụ akwụkwọ. Amabeghị ego ole aga-ewepụ n'ụgwọ ọrụ. Onye editọ mgbasa ozi nke BBC bụ Amol Rajan kwuru na ndị a kwenyere na nchabi ụgwọ ọrụ nwetara ezigbo ego n'oge gara-aga. ""Ụwa ahụ agala ugbua ebe ndị ntaakụkọ a ekwetala ka ọkpụrụkpụ ego ha soro ya la""" afirika-44180638,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44180638,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Prince Harry na Lọọlọ ya ekelele ụwa,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Prince Harry na Lolo Meghan ekelele uwa maka nkwado,"Prince Harry na Lolo Meghan N'ofesi, Prince Harry na Lolo ya bụ Meghan ekelela uwa maka nkwado n'agbam akwụkwọ ha ụnyahụ. Prince Harry na Lolo ya bunyere ụkpa ekele a n'abalị mgbe ndị ọbịa pụrụ iche gara meme a n'akụ ngaji n'eze nke bụ emụme ha jiri wete agbam akwụkwọ ahụ na-jedebe. End of Twitter post, 1 Ndị otu Okorocha azachiele ndị otu TOE Ekechị Ebere Nzewuji sị na Ekechi ha amaghị ihe ha n'ekwu. Onye nnukwu ojeozi Govanor Imo Steeti n'ihe gbasara mgbasaozi soshal media bụ Ebere Nzewuji akatọla ọkwụ otu APC Imo nke TOE Ekechi nọ na isi ya. Chioma:Ebere is na ọ bụ egwụ Uche Nwosu jị ndị otu ahụ maka na ha ma na ha agaghị ahụ azụ ya anya ma emegharị ntụilaka nke imeụlọ ndị APC mere na steeti ahụ PDP ebola APC ebubo mkpagbu Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mere ntuliaka imeụlọ n'izu ụka gara aga N'aka ọzọ, ndị otu PDP etiela mkpu na-ebo ndị Pati APC ebubo ikpachi ndị Pati ọzọ ọnụ bụ ndị na-ekwetaghị na ha site na ịjide, ị tụha mkpọrọ maọbụ memi na ha. Onye kwuru nke a bụ ode akwụkwọ mgbasa ozị ndị otu a bụ Kola Ologbondiyan mgbe ọ gwara ndị nta akụkọ okwu ụnyahụ n'Abuja. Onwebeghị ihe ndị APC sara gbasara nke a ka ọdị ụgbụa. Chelsea eburula iko Emirate Jose Mourinho sị na Chelsea agbataghị bọlụ agbanyeghị na ha buru iko Emirate N'egwuruegwu, Chelsea ewerela otu ọkpụ maburu iko Emirate FA agbabiri ụnyahụ. Ebe Jose Mourinho bụ onyenkuzi ndị Manchester United n'ekwe ha n'aka maka mmerie a, ọ sị na Chelsea ekwesịghị ị bụ ya bụ iko site na ka ha sịrị sọ ya bụ mpi. Gee ya na nkeji nke ututu a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Sịneti: Uru dị n'iwu azụmaahịa ọhụrụ" afirika-44272698,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44272698,Ihe 8 onyeisala Buhari kwuru maka ụmụaka taa,Ụbọchị 27 ọnwa Mee afọ niile bụ ụbọchị pụrụiche a na-eme mmemme ncheta ụmụaka n'ụwa niile.,"Nicole Benson tụkọtara onyeisiala ego ruru puku naịra ise na narị asaa na kọbọ iri asatọ na ise Onyeisiala Muhammadu Buhari sonyere ụwa niile ma tinye olu ya n'ọdị mma ụmụaka site n'akwụkwọ ozi o dere iji kelee ụmụaka. N'akwụkwọ ozi ya, Onyesiala kpatụrụ ọtụtụ ihe aka etu o si gbasara ụmụaka na Naịjirịa nakwa ihe gọọmenti ya na-eme iji hụ na ụmụaka Naịjirịa nwere nchekwa tọọrọ atọ. O kwuru ihe gọọmenti ya megoro na nke ha ka ga-eme ichekwa ụmụaka na Naịjirịa. Ihe 8 Onyeisiala kwuru: Ihe ndị Buhari na-ekwughi Mana o nwekwara ihe ndị ọ na-ekwutaghị maka ya n'akwụkwọ ozi ahụ. O kwuteghi okwu gbasara ụmụaka ndị Chibok ndị fọrọ n'aka ndị Boko Haram ndị a na-agbapụtabeghi, bụ ndị nọrọla afọ ise n'aka ndị Boko Haram. N'aka nke ọzọ, o kwughikwa maka nwantakịrị nwaanyị bụ Leah Sharibu bụ otu onye ndị Boko Haram jụrụ na ha agahị ahapụ oge ha hapụrụ ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ọzọ ha tọọrọ n'obodo Dapchi dị na Yobe steeti. Leah Sharibu ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram maka na ọ bụ onye na-ekpe okpukpe ụka Kraịst. Oge a hapụrụ ụmụaka a tọọrọ ya na ha, ha kwuru na ọ dị ndụ mana amaghị ka ọ ka dịkwa ndụ. Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa agbapụtabeghi ya, ma onyeisiala Buhari ekwutaghịkwa maka ya n'ozi o zipuru maka mmemme ncheta ụmụaka taa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45614438,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45614438,Nigeria: Ụmụaka ụmụnwaanyị a na-ere iji kwụọ ụgwọ,Site n'omenala obodo Becheve dị na mpaghara ndịda Naịjirịa ebe a na-ere ụmụaka ụmụnwaanyị maka i ji akwụ ụgwọ nne na nna ha ji.,"A na-eresi ụmụaka ahụ ndị okenye ụmụnwoke ruru afọ iri itoolu ma ọ bụ ndị bụ ọgbọ nnanna ha dịka ihe eji agbaziri ego ma ọ bụ eji akwụ ụgwọ. Otu nwagbọghọ akpọrọ Dorothy kọwara etu esi ree ya nakwa etu ndị mmadụ si jide ya aka ka nwoke ahụ nwee ike kwaso ya iko n'ike. Onye Ụkọchukwu Akonnam Richards gwara BBC na ụfọ ụmụaka ndị a bụ ndị a na-eme ka ha rụọ ọrụ karịrị ha. O kwuru na ụfọdụ na-atụrụ ime n'oge ha na anọ n'aka ndị nwoke eresiri ha. Mana onyeisi obodo Becheve bụ Sunday Ichile kwuru na oge ụdị ihe a mere agaala, na akagburu ya n'afọ ndị dị n'okpuru afọ 1990. Happiness gwara BBC na nwoke zụtara ya na-akụ ya ihe oge ụfọdụ, na ọ na-agwa ya na ọ bụrụ na ọ kụọ ya ihe, na onweghi onye ga-ekwu okwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49785914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49785914,Ipob: Nnamdi Kanu kwetere ka m zụọ ndị otu ya,Onye nwe ụlọọrụ Air Peace bụ Allen Onyeama agwala BBC Igbo etu o si dozi nsogbu kwarapụ (quit notice) nke ndị Ugwu nyere ndị Igbo bi na be ha n'afọ 2017.,"Allen Onyema O jikwa ohere a wee kọọ ka o si kpọrọ Mohammed Danjuma (Onyeisi Arewa Transformation and Empowerment Initiative) gaa ị ga-kpe udo na be Nnamdi Kanu maka ya bụ kwarapụ. - Onyema kwuru na ya na Danjuma natara ohere n'aka onyeisiala Muhammadu Buhari tupu ha agawa ị gwa Kanu ka o medalata obi. - O kwurukwara na Kanu nabatara ha ma kwete ka ọ zụọ ndị otu ya makana ọ chọghị ka ndị otu ya were mkpari na-eso etu esi achọ ihe ha na-achọ. - O kwuru na Nnamdi Kanu gwara ya na ọ hụrụ ka o si zụọ ndị nọ na Niger Delta, ma kwuo na ọ ga-anụrụ okwu ya bụ Onyema. - Ọ gara n'ihu kwuo na Nnamdi Kanu kpọpụtara nwanne ya nwoke nke nta ka o nye aka chịkọta ndị Ipob maka ndị America ọ kpọtara ka ha nye ha ọzụzụ. - Allen kwuru na ọ gaghị ekwucha ihe niile ya na Kanu kpara. Lee ka ọ ha ya n'ọnụ ebe a Ejidela otu na-agba mgbere nwa ọhụrụ Ndị uweojii na Legọs anwụchiela ụmụ nwaanyị abụọ na-ere nwa ọhụrụ na mpaghara Ejigbo na steeti ahụ. Ha napụkwara ụmụ nwaanyị ahụ otu nwa nwoke ọhụrụ ma kuga ya n'ụlọọgwụ maka inyocha ya ahụ. E nyere aha nwaanyị abụọ ahụ dịka Gift Michael na Florence Nkem Douglas. Ha kọwara na ha na-ere ụmụ aka site na puku narị ise rue otu nde site maọbụ nwa nwoke ka nwa nwaanyị. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ọtụtụ ehi na-agagharị n'ime obodo Enugu Mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo otu obodo di na Adamawa steeti Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ndị ohi ehi kpara ya bụ mkpamkpa n'okpuruọchịchị Numan na steeti ahụ N'ofesi, Ndị mmadụ na mba Ijipt emeela ngagharịiwe nke ụbọchị abụọ megide onyeisiala ha bu Abdul Fattah Al-Sisi nke ha sị ritue n'ọchịchị. Ndị uweojii gbara ha anwụrụ anya mmiri iji chụsasịa ha ma nwụchie ụfọdụ n'ime ha. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Soyinka akatọla gọọmenti etiti Ọ bụ ihe mere ede ji bee nwii dịka ode akwụkwọ a ma ama bụ Wole Soyinka chịrịla wunyere gọọmenti Naijịrịa. Soyinka kwuru na ebubo ọhụrụ e boro onye nchịkọta 'RevolutionNow' bụ Omoyele Sowore metụtara imegide ọchịchị obodo, mpụ ego nakwa ihe ndị ọzọ adabaghị ma ncha. O kwuru na agwa a yiri agwa onye isi kopuru ekopu. Soyinka katọrọ ebubo a n'akwụkwọ ozi o degaara ụlọ mgbasaozi 'Channels' n'ụbọchị Satọde. Cheta na ka Omoyele Sowore ka nọ n'aka ngalaba nchekwa Naịjirịa akpọrọ ""Department of State Security"" (DSS) kamgbe a nwụchiri ya ihe karịrị abalị iri anọ gara aga. Gọọmenti etiti kpụpụrụ Sowore ụlọikpe ebe ha boro ya ebubo ruru asaa. DSS sịbụ ka enye ha ohere ijide Sowore ruo abalị iri itoolu mana ụlọikpe nyere ha ohere ijide ya ruo abalị iri anọ n'ise. Sowore bụ onyeisi ụlọọrụ mgbasa ozi 'Sahara Reporters' ma bụrụkwa onye ji ọkọlọtọ 'African Action Congress' wee zọọ oche onyeisiala na ntuliaka 2019. 'Mmeri Ihedioha sị n'aka Chineke' -Onye enyemaka ya Ọnụ gọvanọ Emeka Ihedioha bụzị sọ ọchị ọchị Ọṅụ juru elu na ala n'Imo Steetị n'ụbọchị Satọdee dịka ụlọikpe ntuliaka weliri aka Emeka Ihedioha dịka onye tuuru ugo n'ezie na ntuliaka gọvanọ e mere n'ọnwa Maach afọ a. Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka Ihedioha gwara BBC Igbo na mmeri a kwesiri ịbụ ohere mmadụ niile ga-eji bịakọta ọnụ ka e dozie Imo steeti. Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Hope Uzodimma bụ ndị wepụrụ okwu ntuliaka ahụ n'ụlọikpe na-arịọ ka a kagbuo mmeri Ihedioha. Ha boro ebubo na mmeri Ihedioha dara iwu na-achịkọta mmeri ntuliaka na Naijirịa. Osote onyeisiala Yemi Osinbajo Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ịkwalite ịdịkọnotu n'ime ndịiche bụ ụzọ kacha mfe Naịjiria ga-esi nweta ọganihu. N'okwu ya na mahadum Osun steeti n'ụbọchị Satọdee, Osinbajo kwuru na ihe mmụta pụrụ iche juru na ndụ Nnamdi Azikiwe, Ahmadu Bello, na Obafemi Awolowo bụ ndị ndu Naịjiria n'oge gboo. O kwuru na mmadụ atọ ndị ahụ si mpaghara dị icheiche mana ha na-ekwekọrịta mgbe ọbụla okwu maka Naịjirịa malitere. N'ofesi, Ọgbakọ mbaụwa bụ 'United Nations' anabatala atụmatụ udo nke ndị otu oyi egwu a kpọrọ Houthi Rebels na mba Iran wepụtara. Ndị otu a na-ekwu na ha ga-akwụsi imebisi akụrụngwa e ji amịpụta mmanụ agbidi na Saụdi Arebia ma ọ bụrụ na mba Saudi kwụsị itụ ha ogbunigwe. N'egwuregwu David meriri Goliath ọzọ mgbe ndị otu bọọlụ Granad nke mba Spen ji ọkpụ goolu abụọ dụkpọọ ndị Barcelona anya n'abalị Satọdee. Nwaafọ Naịjiria bụ Ramon Azeez so na ndị nyere goolu na asọmpi ahụ. Lionel Messi na Suarez emenwughị ihe ọbụla iji zọpụta oyu ha bụ Barcelona. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Di m sị anyị lawa na ọ na-abịa - Nwaanyị si South Africa lọta" afirika-48264145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48264145,Caramelo Lounge: Ọ bụ obi ọjọọ ka eji kwatuo ụlọ oriri na nkwari a,Ọ bụ eziokwu na akwatụrụ ụlọ awantịlọ Caramelo nso nso a mana ọtụtụ mmadụ anabatachaghị ya bụ atụmaatụ.,"Onye ọkaiwu ama ama aha ya bụ Goody Uwazuruike ekwuola na ọ bụ obi ọjọọ ka ndị ụlọ ọrụ kwatụrụ ya bụ ụlọ ji mee ya. N'ọnụ okwu ya, ""Ndị a kpara agwa a ka ndị otu Sharia na-eme tigbuo zọgbuo maka obibi ndụ ndị ọzọ na-amasịghị ha."" End of Twitter post, 1 Uwazuruike kwuru na ihe ziri ezi ha kwesiri ime mgbe ha nwetere mkpesa ndị bi n'akụkụ bụ ịkpụpụ onye nwe ya bụ ụlọ orirri ụlọikpe. O kwuru na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebizi ihe a ga-eme ya bụ ihe. O nyekwara onye nwe Caramelo ndụmọdụ ya ga n'ụlọikpe ga kpesa ya bụ nkwatụ akwaturu ụlọoriri ya makana ọ gba nkịtị ihe kaa nke a ga-eme ọzọ. Cheta na akụkọ pụtara na gọọmenti Abuja kwatụrụ ụlọoriri na nkwarị Caramelo dị na Utako ka otu izu ụka gachara ndị uweoji ji nwụchie ụmụnwaanyị echere na-agba ọwantịlọ na ebe ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47272120,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47272120,Atiku: Ngalaba EFCC anwụchiela onye ọkaiwu ya,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị EFCC anwụchiela onye ọkaiwu Atiku Abubakar bụ Uyi Giwa Osagie na Legọs.,"Akụkọ dị mkpa: E chere na a nwụchiri ya maka akpa ego e si Abuja ebuga Legos nke ndị ngalaba EFCC kpụghere mana o dobeghi anya ma nnwụchi a o metụtara ọrụ ya n' achụmnta vootu Atiku. Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha. Ngalaba Inec ekwela nkwa ilekọta ndị na-efe ala nna ga-eso ha arụ ọrụ ntuliaka anya ọfụma. Cheta na ndị mmadụ kpụ Inec n'ọnụ maka etu ha si hapụ ụmụ mmadụ chi horo ụbọchị ehigharịrị ntuliaka. BBC Igbo agbaala otu afọ, Oru na Igbo BBC Igbo agbaala otu afọ na mgbasa ozi taa. N'ụbọchị a n'afọ gara aga, ka BBC Igbo malitere mgbasaozi dịka otu n'ime ndị e kewapụtara na mgbakwunye BBC W2020 maka ndị asụsu na-abụghị bekee. Obi dị anyị mma maka ncheta ọmụmụ ụlọọrụ a, ma na-asị chere aka ghọrọ anyị n'ike na ebube. N'ofesi, Steeti iri na isii gụnyere Kalifonia, agbaala onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, akwụkwọ, maka mkpebi ya itinye ọnọdụ gbatagbata maka inweta ego o ji arụ mgbidi aja maka oke ala ha na Mekziko. Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onye ọkaikpe ukwu nke Kalifonia bụ Xavier Becerra, kwuru sị na ha na-agba ya akwụkwọ a ime ka ọ ghara imefu ụtụisi ndị mmadụ tụtara. N'egwuregwu, Ọ ka na-akpọtụ n'isi ndị Chelsea, ka ndị Man Utd gosiri ha nkarị ma jiri ọkpụ goolu abụọ gbapụ ha n'asọmpi Iko FA. Ajụjụ bụzị 'isi Chelsea a ga-apụtakwa ma ha zute Manchester City n'agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa a? Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị nwere taa: Nnamdi Kanu: Ana m abịa n'ike na ebube" afirika-57275683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57275683,Farouk Yahaya: Ihe 10 dị mkpa ị kwesịrị ịma maka onyeisi ndị agha Naijirịa ọhụrụ,Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari etinyela Major General Farouk Yahaya dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị agha Naijirịa.,"Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndi agha Naijirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee afọ 2021. Tupu e mee ya onyeisi ndị agha, Yahaya bụbu onye na-achịkọta Division 1 nke ndị agha Naijirịa ma bụrụkwa onye na-achikọta 'Counter Terrorism Counter Insurgency' nke ndị agha na mpaghara ugwu nke a kpọrọ operation Hadin Kai. Lee ihe iri ị kwesịrị ịma maka nwoke a 1) Ọ bụ onye obodo Bodinga nke dị na Sokoto Steeti 2) A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 1966 3) Ọ bụ onye alakụba 4) Ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta asambodo 'Bachelor of Arts nke History, na M.SC International Affairs and Diplomacy 5) Ọ bụ n'afọ 1985 ka o bidoro ọzụzụ dịka onye agha ala Naijirịa 6) Lee etu o siri gbagote bụrụ Major General 7) Ọ ritela nturuugo iri abụọ dịka onye agha nke gụnyere 'Field Command Medal' na 'Golden Jubilee Medal'. 8) Ọ na-asụ asụsụ Bekee, Awụsa, Arabic na Spanish 9) Ọ na-amasị ya ịgụ akwụkwọ, ịme njem, ịma njakịrị na ige egwu ndị Naijirịa. 10) Ọ lụrụ nwaanyị ma nwee ụmu anọ" afirika-51410891,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51410891,Igbo Language: Ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo,Gọọmentị Anambra steeti amanyela iwu gbochiri ụlọa kwụkwọ na steeti ahụ ịta ụmụakwụkwọ ahụhụ maka ịsụ asụsụ Igbo.,"Ha kwuru na o megidere iwu ji steeti ahụ ịtya nwata ọbụla ahụahụ maọbụ ịda ha nha ma ha sụọ Igbo n'ụlọ akwụkwọ. Dịka ọ dị ugbua amaghị ma mmachị a ọ gụnyere Mahadum mana ọ bụ n'ụlọ akwụkwọ pramarị na sekọndrị ka ihe a kachasị eme. Asụsụ Igbo agaghị anwụ - Amarachi Atama O nwere ụfọdụ ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ si akwụsị ụmụaka ị sụ asụsụ Igbo nke ụfọdụ che na ọ bụ ihe Bekee na-akpọ 'Vernacular' n'ime ụlọ akwụkwọ. Ha na-ada anyị nha Chukwuname Obiejesi bụ onye ntaakụkọ BBC gụrụ akụkwọ nỌwụwa Anyanwụ Naịjirịa kọwara na mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị, a na-ada ha nha ""A na-edetu aha ndị sụrụ Igbo ma napụta ha naịra iri na ngwụcha ụbọchị"" ka o kwuru. Ịma njakịrị Kelechi Agbanelo kwuru na ya na onwe ya ahụghị iwụ ọbụla machiri ịsụ asụsụ Igbo mgbe ọ gụrụ akwụkwọ. ""E nweghi iwu pụrụiche megidere ị sụ Igbo mgbe ahụ mana ụmụakwụkwọ ị be gị ga na-amasa gị njakịrị"" ka o kwuru. Ị ta ahụhụ Onye ọzọ anyị jụrụ ajụjụ bụ Chimezie Ucheagbo kwenyere n'ihe Maazi Agbanelo kwuru. O kwuru na a na-ata ha ahụhụ ndị dịka ịsị ha sekpuru ala maọbụ bara ha mba. Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche. O kwuru na ụlọakwụkwọ dị icheiche kwesiri ịtinye aka ka awụlite asụsụ Igbo kama ị na-akwụsị ya. Ọ fọziri ị ma ma steeti ndị ọzọ n'ala Igbo a ga-eṅomi atụmatụ a. Na Legọs steeti, ọ bụzi iwu na onye ọbụla chọrọ ka ọ gụọ mahadum ga amarịrị ịsụ Yoruba." 49257781,https://www.bbc.com/igbo/49257781,"Igbo Culture: Kedụ ndị bụ ""Ụmụada"" n'ala Igbo?","Na mgbe gboo, e nwere otu ụmụnwaanyị dịgasị iche iche n'ala Igbo ndị ọrụ ha dịkwa iche iche.","Ụmụada bụ otu ụmụnwanyị kacha nwee ikike n'ala Igbo E nwere ndị dịka otu nze na ọzọ, otu mmonwụ, otu ọgbọ, edz. Mana otu n'ime ndị kacha nwee ikike bụ otu ndị Ụmụada. Kedụ ndị bụ ụmụada? Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada Nwaanyị ọbụla a mụrụ n'obodo bụ ada n'obodo ahụ. Ọbụrụgodu na nwaanyị alụọ di, ugwu ya ka kwụ chịm n'obodo a mụrụ ya. Ọ bụ ụmụwaanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada na-agbenyeghi obodo ebe a na-alụ ha. Mana dịka Odoziakụ Celestina Obiejesi onye Obodoukwu n'Imo steeti siri kwu, nwaanyị alụghị di nwekwara ike isonye n'otu ụmụada. Aha ọzọ e nwere ike ịkpọ ụmụada Aha a na-akpọ ha abụchaghị otu n'obodo niile. E nwere ndị na-akpọ ha ụmụada, ụfọdụ na-akpọ ha ụmụọkpụ ebe ụfọdụ na-akpọ ha ụmụ mgbọtọ, mana ha ncha pụtara otu ihe. Ọrụ ndị ụmụada n'obodo Ụmụada na-ejịkọ Obodo Dịka Nwokocha Benedicta Akuezi onye Ahiazu Mbaise siri gwa BBC, ọrụ ndị ụmụada buru ibu n'ala Igbo. Ha gunyere, ịkpa udo, igbo mkpa, ikpebi ikpe siri ike, ịta onye dara iwi ahụhụ, ịkpa obioma, dgz. O kwuru sị: ""Ihe siwe ike, maọbụ nsogbu dị n'obodo nke amakwaghị ihe a ga-eme ya, a na-akpọ ụmụada ka ha bịa tinye okwu dị otu ahụ ọnụ. Ụmụada anaghị ekpe ikpe ezighi ezi ""E nwere nkwenye na mgbe ọbụla ụmụada tinyere ọnụ n'okwu, okwu ahụ ga-eberịrị. ""Mana ọ bụrụ na ndị okwu ahụ dị n'aka achọghị udo, ụmụada nwere ike kụọrọ ha ọfọ maọbụ bọọrọ ha ike."" Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya Akuezi kọwara ịkụ ọfọ dịka ihe a na-eme ka chi ndị obodo na-efe were aka ya taa onye ikpe mara ahụhụ. ""Onweghi onye ụjọ ga-ekwe ka ụmụada bịa kụọrọ ya ọfọ. ""Onweghikwanụ onye ọ ga-amasị ka ụmụada bị gbaara ya ọtọ. ""Ya mere na mgbe ọbụla ndị ụmụada kwuru okwu, a na-akwanyere okwu ha ugwu nke ukwuu."" Ihe ụmụada na-eri na ihe ha na-asọ Ụmụada bụ ndị na-akpa udo bụrụkwa ndị na-akpa obi ọma Na mmemme ọbụla dịka nkwụnwaanyị maọbụ olili ozu, ihe oriri ụmụada na-apụ iche. Ọ bụrụ na e gbuo ehi maka mmemme, a na-edowere ụmụada ukwu ya iche, ya na ihe oriri ndị ọzọ dịka akpụ, abacha, na mmanya pụrụ iche. Emeghị otu a, mara na onye ahụ ekotela okwu n'ihi na ụmụada ga-ada ya nha. Mana Celestina Obiejesi kwuru na ihe oriri anaghị ebutekarị esemokwu. ""Ụmụada ma ole aka ha onye. Ha anaghị asị ka e nye ha ihe ga-agbaji ndị na-eme ihe aka."" N'aka nke ozo, ụmụada na-asọ okwu asị, aghụghọ nakwa mmegbu. Nwaada Igbo anaghị anọ ebe a na-ekpe ikpe ezighi ezi. Kirie egwu ndị nne gbara n'ụkanne Mana nwaada ọbụla mehiere nwekwara ntaramahụhụ pụrụ iche ndị ada ibe ya ga-enye ya. Obiejesi kwuru, ""Nwaada ọbụla mejọọ, a ga-akpọ ya ikpe n'ọgbakọ ụmụada ma taa ya ahụhụ. ""Ahụhụ dị otu a nwere ike bụrụ ịchụpụ onye ahụ n'otu ha maọbụ machie mmekọrịta ya na ndị mmadụ n'obodo ihe ruru afọ ise."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49660425,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49660425,Kim Kardashian: Gịnị bụ ọrịa 'lupus' na-arịa ya?,"Kim Kardashian, nwanyị a ma ama na mba Amerịka, kwuputara na ya na-arịa ọrịa a na-akpọ ""lupus"".","Kim Kardashian West O kwuru na ya gbalịrị ihe nille o nwere ike iji ụzọ dị ka chi si kee ya wee gwọọ ya bụ ọrịa mana onwebeghi isi. Ugbua, otu dibia bekee bụ ọkaibe aha ya bụ Dkt Wallace, na-enyezi Kardashian ọgwụ maka ya bụ ọrịa. Kardashian kwuru na ụjọ tụrụ ya mgbe a gwara ya na o nwere ọrịa ahụ. O kwuru na ọbụ mgbe e mere ya nnyocha ahụ n'ọnwa Mee ka a chọpụtara ọrịa a. Anyammiri juru Kardashian anya oge ọ na-akọpụta ihe ndị a na ngwụcha izuuka gara aga. Gini bụ Lupus Kim chọpụtara na o nwere ọrịa ""lupus"" n'ọnwa Mee, tụpụ a mụọrọ ya nwa ya nwoke ""Lupus"" so n'ọrịa nke bekee kpọrọ ""autoimmune diseases"". Dịka Chioma Ofoekii onye bụ dibia bekee si kọwwara BBC Igbo, e nwere ihe ndị dị n'ime ahụ mmadụ nke na-enye aka iji gbochie ọrịa. Mana mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ na-egbochi ọrịa nwekwara ike tụgharịa buso ahụ mmadụ agha. ""Ọbụ mgbe ihe dị otu a mere ka a na-ekwu na mmadụ nwere 'autoimmune disease'"". Ofoekii kwuru na ọbụ ụmụnwanyị na-enwekarị ụdị ọrịa ndịa. Mana ọpụtaghị na nwoke anaghị enwe ya. Ọmụmaatụ ụfọdụ ọrịa ndị a gụnyere, ọrịa agba ikpere tụmadi nke a kpọrọ (Rheumatoid arthritis), dayabitis nke mbụ (Type 1 diabetes), dgz. Kedu ka ọrịa ""Lupus"" si eme mmadụ? Onye ihe ghakasịrị n'ahụ n'ihi ọrịa ""Lupus"". Ọrịa ""Lupus"" na-emetụ akụkụ ahụ dị icheiche. Ọ na egburi njikọ ọkpụkpụ, na emetụta akpụkpọ ahụ, kidini, ọbara, ụbụrụ isi, obi nakwa ngụgụ. Onye na-arịa ọrịa ""Lupus"" nwere ike ị na-enwe oke ike ọgwụgwụ, mgbu na njikọ ọkpụkpụ, ihe ịghakasị n'ahụ, oke ahụ ọkụ, dgz. ""Lupus"" e nwere ọgwụgwọ? Dibia bekee Chioma Ofoekii Dịka nwaada Ofoekii sị kwuo, ọrịa niile a kpọrọ 'autoimmune' anaghị enwe ọgwụgwọ. Otu aka ahụ, e nwebeghị ụzọ ọbụla a ma e nwere ike iji gwọọ ọrịa ""Lupus"" ka ọ laa kpam kpam. Mana ndị ọkacha mara kwuru na ihe ka mma bụ ịchọ ụzọ a ga-esi ebelata ụmụ ọrịa ndị ọzọ ahụ ""lupus"" na-akpata, dịka ahụ mgbu, ihe ịghakasị n'ahụ, nakwa oke ahụ ọkụ. Nwaada Ofoekii kwuru na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma. Ọ dọrọ aka na ntị ka mmadụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọbula ọ dara ọrịa. Ofoekii kwuru sị: ""Ọ dịghị mma mmadụ ịnọ n'ụlọ were aka ya na-enye onwe ya ọgwụ."" ""Maka na onye ahụ agaghị ama ihe na-arịa ya."" ""Onye rịawa ahụ, ya gaa n'ụlọọgwụ n'oge ma mee nyocha zuru oke tupu ọrịa ahụ akawanye njọ"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Code Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'" 43427353,https://www.bbc.com/igbo/43427353,Nwodo: Biafra agaghị abịa site n'ọgụ,John Nnia Nwodo bụ onyeisi Ọhanaeze ndigbo n'ụwa niile akpọkuela ndị na-achọ nwereonwe Biafra dịka Mba ka ha minye nma n'abọ n'ihe gbasara ọgụ Biafra.,"Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra Nwodo kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ mmụta ihe ndị ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka, Enugu Steeti. O kwuru na nnwereonwe Biafra abụghị site n'ịlụ ọgụ, esemokwu maọbụ ịkparị ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: ""Anyị agaghị enweta Bịafra site n'ịlụọgụ na ịkparị ndị mmadụ, anyị agaghị edọzi obodo site n'itimkpu, anyị ga-enweta ya site n'usoro ndọrọndọrọ. na-ikwu eziokwu."" Nwodo kwuru. Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra Na nzaghachị, mgbe BBC Igbo gbara onye ọdeakwụkwọ ndị Ipob bụ Emma Powerful ajụjụọnụ, o kwuru na ihe ha chọrọ bụ ntuliaka nwereonwe nke akpọrọ 'Referendum' n'asụsụ Bekee na ọ bụghị ọgụ. O kwuru na ọ bụ ihe ihere na onye dịka Nnia Nwodo bụ onyeisi ndigbo ga-ekwu ụdị okwu a. Powerful kwuru na ọ bụ Nwodo kpara nkata mere ndị agha Naịjirịa jiri wakpo ụlọ onye ndu Ipob bụ Nmamdi Kanu ma gbuo ọtụtụ ndị Ipob nke mere na-amaghị ebe Nnamdị nọ ruo taa. BBC Igbo gbara mbọ ị nweta Nnia Nwodo n'ekwentị, ka ọ zara ọnụ ya n'ihe Emma Powerful kwuru gbasara ya, mana ọ zaghị. Gee ihe Emma Powerful kwuru ebe a; Anyị chọrọ ntuliaka 'referendum' ọ bụghị ọgụ." afirika-44431362,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44431362,Onye zụrụ nwaanyị zụrụ obodo — Oriakụ Ezeokoli,Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ụmụnwaanyị na nlekọta ha etola Ijeri dọla atọ ọgbakọ G7 wepụtara maka ọzụzụ nwa nwaanyị.,"Nwa nwaanyị ndị ọgbaaghara metụtara kachasị ata ahụhụ Ogechukwu Ezeokoli bụ onyeisi ọgbakọ na-ahụ maka ihe gbasara nwa nwaanyị akpọrọ 'Tensed' gwara BBC na ọ dịnma etu mba ndị nọ G7 si weputa ego ha etu ahụ ị ji kwado agụmakwụkwọ nwa nwaanyị. Ọ sị na nke a dị nma maka na ọgbaaghara ọ bụla dara n'ezinaụlọ, na ọ kachasị emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke. N'ọnụ ya ""nwaanyị ọ bụla na-agụghị akwụkwọ agaghị enweike gbara onwe ya mbọ maọbụ chọọ ọrụ"". Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a: ""Zụọ nwaanyị zụọ obodo"" Ogechi Ezeokoli Ọ bụghị sọsọ oriakụ Ezeokoli ka ihe a dị ụtọ n'obi. Malala Yousafzai bụ nwata nwaanyị na-akwalite agụmakwụkwọ nwa nwaanyị gorsiri ọṅụ ya n'elu soshal midia maka nke a. O kenekwara ndị otu G7 maka ị kwe ụdị nkwa ahụ. G7 bụ ọgbakọ obodo asaa a na-eme kwa afọ iji kpaa maka ọdịnihu obodo ndị a na ụwa niile, n'afọ a ha wepụtara $3b iji kwalite agụmakwụkwọ nwa nwaanyị. Nke afọ 2018 na-eme na mba Canada ebe Donald Trump, onyeisiala Amerịka jụrụ ị binye aka n'akwụkwọ nkwado G7 aha bụ 'Communique' na bekee. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51928070,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51928070,COVID 19: Gọọmenti ewetuola mmanụ ụgbọala ruo N130,Gọọmentị Naịjirịa ebutuola ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na'otu naịra na iri anọ na ise were ruo na otu naịra na iri atọ.,"Igwe e ji ere mmanụ Ego mmanụ ụgbọala adaala N130 Atụgharịa ya na dọla ọbụrụ $0.35, ọ gaghịzị abụ $0.40. Na nkwado ya bụ ntuziaka onyeisi ụlọọrụ Nigeria National Petroleum Corporation, Mele Kyari ebutukwoola ọnụahịa mmanụ ụgbụọal na stashon ndị NNPC niile bụ ebe ha ga na-erezị mmanụ $0.34. Minista nke steeti nke mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva sị na nke bụ maka imezu nkwa gọọmenti kwere n'afo 2015 mgbe ebuliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ nke dara okwu mgbe ahụ. Nke a pụtara na ọnụahịa mmanụ agbidi gbagokwa ọzọ tupu afọ akwụ, ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-esokwa ya rigoo. Cheta na ọnụahịa mmanụ agbidi si n'elu ọji ebe ọ nọ na $45 daa na $31.52 bụkwa ebe o si sụọ kwu n'ala n'ọnụ $27.46 n'izuụka gara aga bụ nke ndị mmadụ sị na-ahụbeghị ụdị ya kemgbe 1930. Naịjirịa kwadoburu iji ego mbite dị ijeri dọla iri abụọ na abụọ na ụma asaa were mezuo ego akwadoro iji rụọ ọrụ n'afọ 2020 bụ nke ndị ụlọomeiwu nta zodoro ọkpa kemgbe. Onwebeghị onye ma ebe ụsụahịa si na mmanụ agbidi ga-edowe akụ na ụba Naịjirịa ọkachasị ụgbụa ọrịa COVID-19 bịagoro mgba nke ya. Gọọmenti amachiel ndị ọrụ ime njem Gọọmentị Naịjrịa amachiela ndị orụ ha ịme njem ọbụla maka egwu Coronavirus. N'otu aka ahụ ha dọrọ aka na ntị ka ndị ọbụla chọrọ ime njem chaara mba ndị ahụ ha machiri amachị dịka Chaịna, Italị, Amerika. Mba ndị ọzọ ya bụ mmachị metutara bụ Iran, South Korea, Spain, Japan, France, Germany, Norway, UK, Netherlands na Switzerland. Nke a bụ ihe pụtara na nzuko mbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buharị na ndị ọrụ ya nwere gbasara ọrịa COVID-19 nke ọdeakwụkwọ ya nọ n'isi ya. Nnenne si n'ụlọelụ daa n'Anambra steeti Otu agadị nwaanyị gbara afọ iri asatọ na ise esila n'ụlọelụ ogogo anọ matụọ n'Awada dị n'Onicha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed kọwara na ya bụ nwaanyị nwuru maka ada ahụ dị ka isi ezuchaghị ya oke. Saụt Afrịka ajụla ndị so ụgbọmmiri ịritu be ha N'Afrịka, mba Saụt Afrịka ekweghị ka ndị so ụgbọmmiri si Yurobe bata mba ahụ rituo n'ikperemmiri n'ihi egwu ọrịa Coronavirus. Ndị isi ọrụ ahụike na mba ahụ kwuru na ha na-eche mpụtara nynyocha mmadụ isii nọ n'ụgbọmmiri ahụ. Facebook ajụla akụkọ asị Ndị ọrụ Facebook nke Naịjirịa ehiwela amụma nnyọcha ịmata ụzọ aga esi kwusịlata akụkọ asị ana agbasa na ya bụ ọba nzikọrịta ozi. Nke a bụ nke mbụ Facebook na amalite amụma bụ nke ndị gọọmentị Afrịka ụfọdụ na-akwado. Lee mba ndi Gọọmenti Naịjirịa machiri Gọọmentị Naịjirịa amachiela mba ndị coronavirus na-akpa ike ịbata Naịjirịa. Mba ndị ahụ gunyere Chaịna, Itali, Ịran, Saụt Korea, Spen, Japan, Fransị, Jamanị, USA, Nọọwee, UK, Nedalands na Swizaland. Oteela ndị mmadụ ji tiwe mkpu ka amachie ndị si mba ebe coronavirus na-akpa ike. Mba Saut Afrịka, Ghana, Kenya, Moroko na ndị ọzọ emeela nke a. Ọtụtụ mba ndị ọzọ na Yurop nakwa Amerịka emkwaala otu ihe ahụ. Gọọmentị Naịjirịa sị na onye ọbụla si mba ndịa bata ga-anọrọ onwe ha ruo abalị iri na anọ. Gọọmentị Sịkwa na ha agaghị enyezị 'visa' na mbata dịka ha na-emebu. Ihe ọzọ ha mekwara bụ inye ndi Naịjirịa ndumọdụ ka ha ghara ịga mba ndị a. E mechiela ogige ndị kọpa na Naịjirịa Ndị nọ ọzụzụ maka ife ala nna E mechiela ogige ebe a na-azụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ 'National Youth Service Corps' n'ihi ọrịa coronavirus. Nke a na-eme n'isi ụtụtụ ụbọchị Tuzde. Otu onye ezigara Rivers steeti maka ife ala nna gwara BBC Igbo na ndị nlekọta ha gwara ha ka onye ọbụla kwara laa. Onye NYSC ọzọ na Nasarawa steeti gwakwara anyị otu ihe ahụ. Ọzụzụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha na-abụkarị izuụka atọ. Ndị cọpa nọ n'ogige ndị NYSC n'Ọgwụ na-akwakọ ị la N'izu ụka gara aga ka ọzụzụ nke ugbua malitere n'akụkụ Naịjirịa niile. Nke pụtara na ya bụ ọzụzụ were naanị otu izuụka ugbua. Mikel Obi apụọla na Trabzonspor Mikel kwuru na ahụike ndị mmadụ ka mkpa karịa bọọlụ Mikel Obi ahapụla otu egwuregwu bọọlụ Trabzonspor nke mba Turkey. Nke a na-abịa dịka Obi katọrọ etu asọmpi bọọlụ ka si aga n'ihu na mba ahụ na-agbanyeghi mfesa ọrịa coronavirus. Orịa coronavirus mere ka akagbuo ọtụtụ asọmpi n'akụkụ ụwa niile. Mba Briten, Fransị, Spain, nakwa Italị kagbuchara asọmpi ha. Otu UEFA kagbukwara asọmp 'UEFA Champions League' na 'Europa League', ma yigharịa nke 'EURO 2020'. Mana mba Tọki kachiri ntị na-agba asọmpi nke ha, kama ha kwuru na ndị mmadụ agaghị abịa n'ọgbọ egwuregwu ikiri ya. Nke a mere ka Mikel kwuo na o kwesịrị ka a kwụsịtụ asọmpi ahụ iji zọọ ndị mmadụ ndụ. Ka ọ dị ugbu a, Mikel ekwubeghị ma ọ bụ nke a kpatara o ji ahapụ Trabzonspor. Otu bọọlụ ahụ ekwughịkwa ihe mere ha na Mikel ji see okwu. Naanị ihe ha abụọ kwuru bụ na ha ji obi ọcha ha kagbuo nkwekọrịta ha na Mikel. Onye India na Legọs enweghị coronavirus Ngalaba na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti akpọrọ ""Lagos State Ministry of Health"" ekwuola na otu nwoke onye India a na-enyocha ma o bu coronavirus ebughi ya bụ nje. N'ozi ha dere n'akara Twiter ngalaba ahụike a si na nwoke a nọ n'ebe ha na-edewe ndị a na-enyocha, ma kwukwa na a ga-etinyekwu anya n'okwu ya n'ụtụtụ Wenesde. Ugbua ndi achọpụtarala nwere nje a na Naịjirịa dị mmadụ atọ, otu onye mba Itali na ndị Naịjirịa abụọ. Agwọtala otu onye nke Naịjirịa ebe onye Itali ahụ enwetakwala onwe ya. Onye nke atọ bụ onye nke ekwupụtara n'ụbọchị Tuzde. Gọọmentị amachiela ime njem mba ofesi Onyeisiala Buhari na Odeakwụkwọ gọọmentị bụ Boss Mustapha Iji buso ọrịa coronavirus agha, gọọmentị Naịjirịa amachiela ndị ọrụ gọọmentị welitere isi ime njem ọbụla gaa mba ofesi. Odeakwụkwọ gọọmentị bụ Boss Mustapha nyere iwu a n'abalị Tuzde. Ọ dọkwara aka na ntị ka onye ọbụla si mba ofesị alọta dopu onwe ya iche ruo abalị iri na anọ. EU emechiela oke ala ha Otu European Union emechiela oke ala ha ruo abalị iri atọ iji belata mgbasa ọrịa coronavirus. Nke a pụtara na agaghị ekwe onye abụghị onye mba EU bata na mpaghara ahụ. Mmechi oke ala metụtara mba iri abụọ na isii so n'otu ahụ. O metụtakwara mba Iceland, Liechtenstein, Norway na Switzerland, mana o metụtaghị mba UK. Ọtụtụ mba so n'otu EU emechibuola oke ala ha n'ihi ọrịa a." afirika-52703480,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52703480,Ebonyi Assault: Aka m abụọ na-achọ ịkpọnwụ akpọnwụ - Pastor Okochi Obeni,"Ụkọchukwu Okochi Chukwu Obeni, bụ onye ụmụokorobịa kefere aka azụ ma were ụtalị nyụọ ya ịkpakwụ n'Ebonyi steeti nso nso a, ekwuola na aka ya na-achọzị ịkpọnwụ akpọnwụ.","Ụkọchukwu Okochi Chukwu Obeni dina n'ụlọọgwụ Obeni gwara BBC Igbo na ọ ka nọ n'ụlọọgwụ kamgbe ya bụ ihe mechara n'ụbọchị 14 nke ọnwa Mee 2020 a. Ọ bụkwa ego akpa ya ka o ji azụ ọgwụ na ihe ndị ọzọ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ onyeisioche okpuru ọchịchị Afikpo Nọt bụ Ogbonnaya Oko Enyim tinyere aka n'ihe mere ya. BBC kpọrọ Ogbonnaya ugboro ugboro mana ekwentị ya agaghị aga, ọ zaghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị. Obeni kwuru na ihe Ogbonnaya ji kpọọ ya asị bụ maka na ya na-akatọ ọchịchị ọjọọ ya. O kwuru na ugboro ugboro ka Ogbonnaya kpere ya n'aka ndị uweojii mana ndị uweojii jụchara ya ajụjụ ma hapụ ya ka ọ laa. Ogbonnaya Oko Enyim, onyeisioche okpuru ọchịchị Afikpo North Ndị na-arụrụ Ogbonnaya ọrụ mechara gaa kpee ya n'aka otu a kpọrọ Essa Ruling Council, nke bụ otu ọdịnala nke na-elekọta mpaghara ahụ. Ha boro ya ebubo na ọ na-akparị nwa ha nwoke bụ onyeisioche okpuru ọchịchị ha. Ndị Essa Ruling Council nyere iwu ka a taa ụkọchukwu Obeni ahụhụ Nke a mere ka ndị Essa Ruling Council nye iwu ka a kpọta ya, gbaa ya ọtọ, pịa ya ụtalị ma were akpụlekwe nyụchaa ya anya. Obeni gwara anyị na ha kechiri ya aka n'azụ ihe ruru awa abụọ ma na-ata ya ahụhụ. Ndị Essa Ruling Council enyeghi ya ohere ọbụla ịzara ọnụ ya n'ebubo ndị otu Ogbonnaya boro ya. BBC kpọkwara otu onye so na otu Essa Ruling Council aha ya bụ Ezeogo Patrick Aja iji mata ihe merenụ, mana ekwentị ya agaghị aga. Gịnị ga-emezi ugbua? Obeni kwuru na ihe ọ chọrọ bụ ka ndị uweojii nwuchie ndị niile aka ha dị n'ahụhụ a tara ya ma kpụpụ ha ụlọikpe. Ọ chọrọ ka ndị uweojii jide Ogbonnaya Oko Enyim ma mee ka ikpe nkwụmọtọ chịa. Cheta na ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ha anwụchiela mmadụ iri bụ ndị so wee taa Obeni ahụhụ. Yekini Ayoku bụ onye na-arụ dịka kọmishọna steeti ahụ kwuru na ha ga-ahụrịrị njedebe isi okwu butere ụdirị mmegbu a, bụ nke malitere n'ihe Obeni dere na Facebook. Kedụ ka okwu a si mee? Ndị uweojii kwuru na ụkọchukwu Obeni dị afọ iri atọ ma bụrụkwa onye Amasiri dị n'okpuruọchịchị Afikpo Nọt, Ebonyi bịara kpesara ụlọọrụ ha na Julius Nyerere bụ onyeisi otu Isi Oru na ndị otu ya kpọ ya gaa n'ama egwuregwu dị n'obodo ahụ. Ha kechiri aka ya n'azụ ya ma were ụtalị piakachaa ya ahụ nke ukwu ma were mmiri ruru ezigbo unyi wụọ ya. Nke a mere ka akpọga Obeni ụlọọgwụ ka ọ nata ọgwụgwọ ma nwuchie Nyerere na ndị otu ya maka mwakpo ahụ. Nyocha ndị uweojii mere gosiri na ụkọchukwu Okochi natara ntaramahụhụ maka ihe o dere na Facebook katọrọ ihe onyeisi okpuruọchịchị Afikpo North bụ Oko Eyim, ma na-eto igwe obodo ahụ maka ihe ha kpebiri ha ga-eme Eyim na ndị otu ya. Kọmịshọna ndị uweojii n'Ebonyi bụ Ayoku rịọrọ ọha ka ha dere duu makana ya na ndị uweojii na-elebanye anya n'okwu a ka ha were mara ihe kpatara ụdịrị agwa ọjọọ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-50328707,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50328707,Identity Theft: Etu atụmatụ a nwereike ịnapụ gị ihe niile,"Ajụjụ ụfọdụ mmadụ na-ajụ ajụkwanye bụ ""Gini bụ ""Identity Theft""?","Agbanyeghị na atụmatụ a nwereike na-agbagwoju ụfọdụ mmadụ na mpaghara Naịjirịa anya, ndị bi n'ofesi, ọkachasị Amerịka, Canada nadị ọzọ nwere atụmatụ akpọrọ ""Social Security number"" ma maka ya ọfụma. Akụkọ na-ewu ugbua bụ maka nwata nwaanyị a na-ebo ebubo na anapụrụ ndị mmadụ njirimara ha na mba Canada. Dịka ụlọ ntaakụkọ CBC siri dee, ndị uweojii na mba Canada na-ebo Nwaada ahụ ebubo na ozuru aha na ejirimara ọtụtụ mmadụ ma were aha ha na-azụta ihe masịrị ya. Nke dị ya mfee makana ndị mba ofesi ụfọdụ nwere ihe Bekee kpọrọ ""Credit Card"", nke pụtara na inwereike go ihe n'aka ma kwụọ ụgwọ obele obele. Gịnị bụkwanụ ""Identity Theft""? ""Identity theft"" bụ ụzọ ndị omekaome si ezuru njịrimara ndị mmadụ na nzuzo iji zaa aha. Ndị ohi a zute njirimara mmadụ na ihe ndị ọzọ sonyere ya, ha na-ejikara ya zụọ ihe ma mee ihe ọbụla n'aha onye ahụ ha zuru aha ya. ""identity Theft"" na-etinye ndị mmadụ na'akwa arịri. Ndị ohi njirimara mmadụ nwere ike iji njirimara mmadụ zụta ihe n'intaneti, nata ego n'ọbaego mmadụ maobụ ji na-ebi ndụ na mba dịka onye ahụ nwee aha ahụ n'ezie. Ha nwekwara ike iji njirimara mmadụ nata ego maọbụ kpaa arụ dị iche iche nke ga-eme ka onye ahụ gaa nga ebe aka ya dị ọcha. Cyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ Kedu njirimara mmadụ enwere ike izu? E nwere njirimara ndị mmadụ ndị ohi na-akachọkarị nke a mere na ọ dị mkpa na ị matara ha ma chekwa onwe gị. Na Najirịa, lee njirimara ndị kachasị mkpa ikwesiri ichekwa maka ọdịmma gi. Akara mkpọhe Kọmpụta (Password): Nke a bụ akara ndị mmadụ na-eji abanye n'ime otutu ihe ha jị biri n'Intanetị nke gunyere ọba ego, Soshal Midịa, mgbasa ozi 'Email', dgz. BVN: Nke a bụ akara jikọtara ihe niile gbasara ọba ego niile mmadụ na Naijirịa. Aha gị na akara ọba ego niile n'ụlọ akụ sonyere na BVN gị. Akara mkpọhe ATM: Onye nwere aka mpọghe ATM ga-enye mmadu ohere iwere ego dị na ụlọ akụ gị ma onye ahụ nwete akwụkwọ ATM ahụ. Kedu etu ị ga esi gbochie mmadụ izu njirimara gị? Dịka akụkọ a BBC dere siri kọwaa, enwere etu ndị mmadụ ga-esi gbochie mmadụ izu njirimara gị: Nke mbụ bụ na-enweghị uru ọ bara gị igwa ndị mmadụ ihe niile gbasara gị na Soshal Midịa. Ndị enyi gị na ndị ezinụlo gi bụ ndị kwesiri ị ma maka gị ruo ụlọ. Nwee akara mkpọhe kọmpụta siri ike nke ga-egbochi ndị ohi njrirmara mmadụ ịchọpụta ya. Enyela ya ndị mmadụ ma edetu kwana ya n'akwụkwo. Cheta na ọ dịghị mma i ji otu akara mkpọhe emepe ọbaego gị niile. Ọ gịnị bụ 'social media' n'Igbo? Tinye ihe mgbochi 'Anti-Virus' na 'Anti-Spyware' bụ tekụnụzụ eji egbochi ndị omekome iwakpo kọmputa gị ma zuru njirimara gị. Saa anya na mmiri n'akwụkwọ mgbakọ na mwepụ ndị ụlọakụ gị na ezitere gị kwa ọnwa ka ị mara mgbe mmadụ na-esepụ ego n'ọbaego gị. Mgbe ọ bụla ị gara ATM were ego, gbalịa dọkacha akwụkwọ ATM na-egosi ka ọ sị gaa. Okammụta n'ihe gbasara Ịntanetị bụ Mazi Okey Udeogu kọwakwara na ọ bụ ihe gbasara ọbaego ka akacha ezu na Naijirịa Udeogụ nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ hapụ inye onye ọbụla akara mkpọhe ọbaego nke bụ 'PIN' n'okwu bekee. O kwukwara na ụfọdụ ndi ohi na-abịa zite ozi dịka nke ụloakụ gị na ekwu na ha choro ụfodu njirimara gị. Ọ sị na onye nwetere udi ozi a were ụkwu ya gaa n'ụlọakụ jụo ha ese. Kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya- Chidi Udeogu Nke ọzọ mazị Udeogụ kwuru bụ na ndị ohi njirimara na ezitere ndị mmadụ ozi ahụghọ ga-eme ha ka ha nye ha akara ha ji akpọbe soshal Midịa ha. Ozi a na abiakarị na email ọkachasị nke 'Yahoo Mail' Mgbe ndị a nwetere nke a, ha nwere ike rịọwa ndị enyi gị ego n'aha gị. Nke a na-ebute ihe ihere na esemokwu n'etiti gị na ndi mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke" afirika-50754805,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50754805,Punch Editorial: Iwu ise ndị ọrụ ntaakụkọ kwesiri iso,"Okwu ka na-ewu kemgbe ụlọọrụ ntaakụkọ Punch wepụtara edemede ọpụrụiche ha nke Bekee kpọrọ ""editorial"".","N'ime edemede a ha dọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ maka ọchịchị ya. Ka ọ dị, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ma edemede ha ọ dabara n'ume ndị ntaakụkọ. Ide atụmatụ 'editorial' so n'ihe ọpụrụiche ndị ntaakụkọ jiri gosi ebe ha kwụ n'okwu ọbụla. O nwereike bụru ihe banyere ọchịchị, dịka nke Punch dere, maọbụ ihe ọzọ metụtara ha maọbụ obodo n'etu ọbụla. N'ọnọdụ a, ihe Punch dere dabara na ejirimara ndị ntaakụkọ. Mana, o nwere usoro ise dịka iwu ụlọ ntaakụkọ ọbụla kwụwara aka ya ọtọ kwesiri iso. Lee ha ebe a: 1) Eziokwu Agbanyeghi na o nweghị ka onye ntaakụkọ ga-amara nke bụ eziokwu oge niile, ịchụ ma chọpụta nke bụ eziokwu bụ otu n'ime ihe ntaakụkọ ji aga. Mgbe niile, ụlọ ntaakụkọ kwesiri ịna-achọ eziokwu ma kwuo ihe niile dị n'akụkọ ha na-ebu. Oge onye ntaakụkọ agaghị enwetanwụ nke bụ eziokwu n'okwu, o kwesiri ime ka ọha mara n'ime akụkọ ahụ. 2) Nkwụrụ onwe Onye ntaakụkọ kwesiri ịkwụrụ onye ya n'ozi o na-agbasa. O kwesighi ịna-arụ ọrụ ya n'ihi gọọmentị, onye ndọrọ ndọrọ maọbụ ulọ ọrụ ọbụla. Igbo ji ọfo na ogu ama atụ ihe kwụ ọtọ. Akụkọ kwesiri ịkwụ ọtọ 3) Iji ọfọ Akụkọ na-enwekarị ihu abụọ. Nke bụ eziokwu bụ na ọ dịrị onye ntaakụkọ iwepụta ihu abụọ akụkọ siri mee. Ihe niile ma ndị niile metụtara akụkọ ahụ kwesiri ịdị na ya. Akụkọ kwesiri inwe ihu mmadụ 4) Inwe ịhụ mmadụ Onye ntaakụkọ ekwesighi ịkpa arụ maọbụ me ihe ga-emerụ mmadụ maọbụ mụọ ahụ. Ihe a na-ewepụta n'akụkọ nwereike mebie mmadụ ahụ, nke pụtara na onye ntaakụkọ kwesiri ibu n'uche ihe akụkọ ya nwereike imetụta ndị mmadụ. 5) Ịzara ọnụ n'ihu ọha Otu ụzọ eji amata na onye ntaakụkọ kwụbara aka ya ọtọ bụ na ọha nwere ohere ịgba ya ajụjụ. Ya bụrụ na onye ntaakụkọ daa mba, okwesiri ka o mesie ya ma kọwara ọha ihe mere ma rịọ mgbaghara. Onye ntaakụkọ kwesiri ịge ọha ntị, ma dee ihe ọha kwuru na agbanweghi ihe ọbụla. Ihe a dum bụ ihe eji ama ụlọ ọrụ ntaakụkọ na-eme ihe ha kwesiri ime." media-48274073,https://www.bbc.com/igbo/media-48274073,Imo state: Osote onyeisi ụlọomeiwu Imo agbaala arụkwaghịm,Osote onyeisi ụlọ omeiwu atụbala akwụkwọ arụkwaghị m,"Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na osote onyeisi ụlọomeiwu n'Imo steeti bụ Ugonna Ozurigbo agbala arụkwaghị n'ọkwa ya dịka osote onyeisi ụlọomeiwu. Ịgba arụkwaghịm na-abịa n'otu ụbọchị ndị ụlọomeiwu Imo steeti kwụsịrị onyeisi ha bụ Acho Ihim ọrụ maka mbuli o buliri mmachi ndị isioche okpuruọchịchị obodo. Nke a mere ndị na-ajụ ""Kedụ ihe na-emezi n'ụlọomeiwu Imo Steeti""? n'agbanyeghi na ọ fọrọ naanị otu izuụka ka a banye n'ọchịchị ọhụrụ. N'akwụkwọ arụkwaghịm nke o zitere n'ụlọomeiwu Imo, o kwuru na ọ bụ ka o nwe ohere rụọ ọrụ dịka onye nnọchiteanya n'ụlọomeiwu Naịjirịa bụ nke o nwetere na ntuliaka gara aga. Ozurigbo gara n'ihu kele ndị omeiwu ibe ya nakwa ndị Imo steeti maka inye ya ohere, ị rụrụ ha ọrụ dịka osote onyeisi ụlọomeiwu n'Imo steeti. Ndị 'Operation Puff Adder' Ndị uweojii nke Naịjirịa ekwuola na ndị ọrụ ha nke ngalaba 'Operation Puff Adder' anwụchiela ihe ruru mmadụ iri itoolu na atọ bụ ndị o ji egbe ezu n'ime izuụka abụọ na-akpa ike na Kaduna, Niger na Katsina Steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba kwuru nke a n'obodo Katari dị n'ụzọ si Kaduna gawa Abuja. O kwuru na ndị uweojii ọrụ ha ibuso ndị ohi, ndị ntọrị nakwa ndị omekaome agha natara ha ngwa egbe karịrị narị ise. Ụlọomeiwu anabata Emefiele Ndị ụlọomeiwu etinyeaka n'akwụkwọ kwadoro onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele ịnọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise na-abịa abịa. Na nke yiri ibe ya, ụlọomeiwu gakwara n'ihu gbanwe ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya nke Naịjirịa site n'ụbọchi iri abụọ na itoolu ọnwa Mee gaa n'ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juun. Gọvanọ Ikpeazu enwetela mmeri n'ụlọikpe Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka n'Abia Steeti akachapụla mkpesa abụọ nke Kelenna Ogbonna bụ ọkaiwu pati ADC na APP mere megide mmeri gọvanọ Okezie Ikpeazu na ntuliaka afọ 2019. Ụlọikpe a kwuru na ndị mere mgbesa apụtaghị n'ịhụ ụlọikpe bịa zara ọnụ mgbesa ha. Nke fọrọ bụ mkpesa Alex Otti na Uche Ogah bụ nke a ga-ebe anya n'ụbọchị iri abụọ na asaa ọnwa Mee. N'ofesi Theresa May bụ Praịm Mịnịsta mba Briten a nabatala ọkụ ndị ụlọomeiwu na-akwa ya maka họpụta ụbọchị a ga-eme ntuliaka onye ga-anọchi anya ya. Akụkọ kwuru na May ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ma ọ bụrụ na ọ daa na ntuliaka 'Brexit' na-abịa n'ọnwa Juun. N'egwuregwu Nwafọ Naịjrịa a kpọrọ Fikayo Tomori a mụrụ na mba Canada na-agbara Chelsea bọọlụ kwuru na ọ dị njikere ịgbara Super eagles bọọlụ ma ọ bụrụ na-akpọọ ya oku. Tomori kwuru na ọ hụla ụkwụ bọọlụ ndị Canada na England mana nke Naịjirịa ga-akara mma. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ' Umahi omeriela n'ụlọikpe? Gọv. Dave Umahi nke Ebonyi steeti Ụlọikpe chere were bụ 'election tribunal' dị n'Abakaliki, Ebonyi steeti, ewezugala akwụkwọ Sunny Ogbuoji nke APC gbara Gọvanọ Dave Umahi nke PDP maka ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị, afọ 2019. Ọkaikpe Sunny Ogbuoji bụ Michael Odo, sị na ha achọkwaghị ịga n'ihu na ya bụ Ikpe mere na ụlọikpe ahụ dara ha nha otu puku narị narịa maka nke ahụ. 'Kwusịkwa Emirate ozugbo!' N'akụkọ ọzọ dịka ibe ya, ụlọikpe ukwu na Kano steeti agwala ndị gọọmenti ebe ahụ ha sepu aka n' ikeri oche eze obodo ahụ ụzọ anọ dịka ha mere. Jọstis Nasiru Saminu bụ onye kpebiri ya bụ ikpe kwuru na gọọmenti kachiri nti kpunye ndị eze ahụ okpu na abali iri na atọ ebe ụlọikpe a kpebiri ya bụ ikpe n'abali iri nke ọnwa Mee. Mana gọọmenti sị na nke a abụghị eziokwu. Trump enyela ikike ka akwụsi iji ndị IT mbịara mbịara rụọ ọrụ n'US Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ofesi, onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump enyela iwu ka ha amachie ụlọọrụ cọmpụta ndị mbịa mbịa ịrụrụ ndị mba Amerika ọrụ. Onweghi ndị akpọrọ aha na ya bụ iwu mana a na-ele anya na ya bụ iwu n'arụgara ọlụọrụ Hauwei aka maka ebubo a na-ebobo na China nwere ike iji ya yopuo ihe ndị mba ọzọ na-eme. Sharapova apụọla na French Open Maria Sharapova meruru ahụ nisiaka nke mere na ọ gaghị eso pịa asompi Freench Open nke 2019 N'egwuruegwu, oke nwaanyị mba Russia eji tennis mara bụ Maria Sharapova sị na ya agaghị eso n'asọmpị French Open nke afọ a ga-amalite na abali iri abụọ n'isii nke ọnwa Mee a. Nke a bụ maka ekwo o chikwopuru mgbe gara aga. Gee Nkeji ụtụtụ taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasi-gi" afirika-46889233,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46889233,"10-year E-passport: Ị ga-akwụli naira 70,000 maka ya?",Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ebidola ikwu uche ha gbasara akwụkwọ njem ọhụrụ e wepụtara a kpọrọ 'International Passport' maka afọ iri.,"Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara akwụkwọ njem ọhụrụ a. Ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata(Immigrations) kwupụtara na ọnụ ya bụ akwụkwọ njem ga-abụ naira puku iri asaa. End of Twitter post, 1 Agwa ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ bụ ọbara ọbara dị iche na ndị ochie bụ agwa akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ: Chiamaka Imoh kwuru na ọ dị ka ọ ga-eji akwụkwọ ngosi onwe dịka NIM iji mee njem maka ọnụ akwụkwọ njem a. Toni Johnson kwuru na ọnụ a zuru iji chụpụ ndị ọchịchị n'ọkwa ha. Cheta na mgbe e wepụtara akwụkwọ njem a ọhụrụ, otu onye ọrụ ngalaba ọpụpụ na mbata gwara BBC na ọ bụghị iwu na onye ọbụla ga-enweta ya bụ akwụkwọ njem ọhụrụ. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a. Akwụkwọ njem afọ iri ekpuchighi onye ọbụla - Ngalaba na-ahazi njem Akwụkwọ ndịọzọ ga-amasị gị" afirika-47664243,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47664243,Talcum Powder: Ị ma na nzu bekee nwere ike inye gị maọbụ nwa gị ọrịa kansa?,Ndị ọkaibe n'ihe gbasara ahụike nke akpụkpọ ahụ nakwa kansa akọwala na ite nzu bekee nwere ike i butere gị ọrịa kansa.,"ụmụnwaanyị ji nzu bekee achọ mma, ụfọdụ na-ete ya na-apata ụkwụ iji gbochie nkwọkọta ụkwụ ha abụọ, ebe ọtụtụ na-ete ya nwa ọhụrụ iji gbochie akpụkpa ịta ha n'ike n'ihi oke ekpomọọkụ. Mana ndị ma ihe a na-ekwu n'ahụike kwuru na ọghọm ahụike nwere ike iso ya. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọkaibe n'ihe gbasara idozi akpụkpọ ahụ bụ Eudoka Nwosu kọwara n'ezie na nzu bekee ụfọdụ na-ebute ọrịa kansa akpa akwa nwaanyị. ""Ọ kachasị ụmụnwaanyị na-ete ya na nso akụkụ ahụ nwaanyị ha."" O kwukwara na nzu bekee nwekwa ike ikogbu nwa ọhụrụ ma ọ banye ya n'imi. ""O nwere ike ime ka nwa ọhụrụ kubie."" Gee ihe Nwosu kwuru n'uju ebea: Talcum Powder: Kwụsilata ka isi ete nzu bekee maka ọrịa Kansa- Ọkammụta akpụkpọahụ Ọkamụta n'ọrịa kansa na ụlọọgwụ Lagos University Teaching Họspịtal(LUTH) , Dr Remi Ajekigbe, kọwara na, ""Ọtụtụ ihe ụmụnwaanyị na-ete n'ahụ ha ji achọ gụnyere nzu bekee nwere ike ibute kansa."" 'E tee ya nzu bekee nwere asbestos n'abụ o nwere ike ịbanye n'ime ara bute kansa ara."" N'ofesi, ọtụtụ ụlọọrụ na-eme nzu bekee ụmụaka emefuola nde kwuru nde dọla n'ikpe ụmụnwaanyị ụfọdụ gbara ha maka ọrịa kansa akpa akwa nwaanyị na-arịa ha. Otu ndị bụ ọkachamara n'ọrịa kansa nke mba Amerịka a kpọrọ, 'America Kansa Association' kọwara na nzu bekee nwere ndị nwere akọrọgwa bekee 'asbestọs' nke nwere ike ibute kansa ma e kuru ya n'imi. Ihe anọ ị ga-eme iji gbochie nsogbu Nwosu na Dkta Ajekigbe nyere ndụmọdụ ndị a: 1. Hapụ ite nwa paụda n'ahụ ha n'ihi na ọ na-akpọchi imi. 2. Kwụsilata ka isi ete nzu bekee. 3. Kama ite nzu bekee maka igbochi akpata, tee okwuma 4. Gụọ akwụkwọ ihe ọbụla e ji achọ mma ka ị mara akọrọngwa e jiri mee ya" afirika-52396610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52396610,"Coronavirus Lock down: Ndakpọ akụnaụba, oke agụụ na ihe ndị ọzọ so 'Lock Down' na Naịjirịa",Ndị gọvanọ steeti niile na Naịjirịa enweela nkwekọrịta imechi njem i si na steeti baa na steeti ruo izuụka abụọ iji belata mfesasị coronavirus.,"Ọ bụ ihe doro anya na ụdịrị mkpebi a nwere otu ihe maọbụ abụọ ọ na-eme na ndụ nakwa akụnaụba ndị obodo. Lock down in Nigeria: Lekwa ka ndị Enugu si nabata ihe ndị China nyere ha Ya mere akụkọ a bụ ka anyị tụlee etu mkpebi ha ga-eji metụta ndụ nakwa akụnaụba ndị Naịjirịa. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe akụnaụba ndị obodo bụ Chidi Lemchi. Ọ sị na otu uru ọ hụrụ gbara ọkpụrụkpụ na mkpebi ndị gọvanọ a bụ na onwereike ibelata mfesasị ọrịa coronavirus dịka ha si kwuo. Mana ọghọm ndị ga-eso nke a buru ibu ọkachasị maọbụrụ na gọvanọ emeghi ihe ndị ha kwesịrị ime tupu ha na-amachi njem a. Lemchi sị na ụfọdụ ọghọm dị na mmechi njem steeti na steeti a gụnyere; Akụnaụba ndị zoro ezo ga-adakpọ: Eke Obigbo dị na Rivas steeti tọgbọrọ chakoo ka ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ Lemchi sị dịka Naịjirịa dị ugbua na ọ bụ akụnaụba ndị zoro ezo si n'aka ndị ọrụ aka di iche iche, ndị azụmaahịa bụ ihe ụmụafọ Naịjirịa ji biri. Mana site na mmechi obodo a, ahịa agaghị azụ, ndị ọrụ aka agaghị arụ ọrụ. Nke a ga-eme ka akụnaụba a dakpọọ bụ nke emetụta akụnaụba ndị a na-ahụ anya. Agụụ ga-arị ibe ya elu: Lemchi sị na agụrụ ga-adị n'obodo karịa ka o si dị ugbua maka na ọtụtụ ndị ""a rụọ e rie"" agaghịzi na-arụ nke ha ga-eji na-eri. Ohi na Mpụ: Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị nri ha ga-eri n'ihi mmechi obodo, na ihe ọzọ ga-abụzi ịchọwa ebe ha ga-ezute ego maọbụ nri ha ga-eri. Nke bụ na ị ga-anọ n'ụlọ mmadụ a bịa kụọrọ gị aka maọbụ bịa buru ite nri na ihe ndị ọzọ. Ọgbaghara ga-adị: Ọ sị na ugbua e mechiri ụfọdụ steeti na e nwetula akụkọ ọgbaghara n'ụfọdụ ebe, ka ụfọdụzie mgbe e mechiri steeti niile na Naịjirịa, na oke ọgbaghara nwereike ịdapụta n'ọtụtụ ebe di iche iche. Lemchi gara n'ihu kwụpụta ihe o chere ndị gọvanọ a kwesịrị ime n'ụdị ọnọdụ a. Ọ sị ka ha nye ohere ka ndị aka ọrụ a ji akụnaụba ndị zoro ezo na-arụ ọrụ ha kama na a ga na-ele ha ahụ kwa ụbọchị maka njirimara coronavirus tupu onye ahụ ebido ọrụ. Ọ kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na enyemaka ọbụla ha ga-enye ga-eru ndị o kwesirị iru aka nakwa n'oke buru ibụ na-abụghị nke otu iko osikapa ụfọdụ na-eketa. N'ikpeazụ ọ sị na atụmatụ ndị gọvanọ dị mma kama ha kwesịrị imezi ụfọdụ ihe tupu ha a na-agbaso ya." afirika-44113802,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44113802,Nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ enyi na-enweghi ihe jikọrọ ha?,"Kemgbe ụwa bidoro, 'ime enyi' dị n'etiti nwoke na nwaanyị na-enweghị ihe ọzọ ga-ejikọ ha, bụ okwu akpụ n'ọnụ kwa mgbe kwa mgbe.","Ndị Igbo na-asị na ""a na-edewe ewu n'ọba ji sị ya atala ya?"" Ya kpatara eji nwee ụzọ dị iche iche a na-esi eso enyi dị n'etiti nwoke na nwaanyị. Oge ụfọdụ, ị ga-ahụ ndị na-ajụ ajụjụ sị 'nwoke na nwaanyị ọ na-abụ enyi?' Ụfọdụ ga-aza gị sị na nwoke ọbụla ya na nwaanyị bụ ezigbo enyi, nwere ihe ọzọ jikọrọ ha, ha na-achọghị ikwuputa. Ndị ọzọ ga-asị gị na enweghi ihe ọjọọ dị na ya, na ha nwere ike ịbụ enyi dị ka nwanne. Mana nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ 'sọsọ' enyi? N'ajụjụ ajụrụ n'igwe okwu ọhụrụ Facebook sị ""nwoke na nwaanyị onwere ike ịbụ enyi na-enweghị ihe ọzọ jikọrọ ha?"" otu onye zara ""Anam anụzị akụkọ ugbu a na ọ rara ahụ nwoke na nwaanyị bụ nwanne ịbụ enyi na-enweghị ihe dị n'etiti ha abụọ ugbu a, ka ọ fọzie mmadụ abụọ na-enweghi ihe jikọrọ ha"" Onye ọzọ a kpọrọ Michael, kwuru sị ""ọ ga-ara ahụ maka na ọ bụrụ ezigbo enyi gị, enwere ụdịrị nkata unu ga-akpagide (ọdịrị nkata na-agaghị eme gị ihere ịkpa n'etiti ezigbo enyi gị nwoke ma ọ bụ nwaanyị) rute ebe obi agaghị ekwe eru gị ala gbasara onye ahụ kwesịrị ịbụ enyi gị."" Stanley Ezeh kwuru sị ""anaghị eji ji ọhụrụ anwa ewu ọnwụnwa. Nwunye m ga-alụ anwakwala anwa chee ụdịrị echiche a, ọ ga-ebu akpa ya laghachị n'ụlọ nna ya."" Nwaanyị na nwoke nwere ike ịbụ ezigbo enyi Ụfọdụ ndị kwere na nwoke na nwaanyị nwere ike ịbụ enyi na-enweghi ihe ọjọọ onye ọbụla n'ime ha bu n'obi. Iheanacho Chigbu kwuru sị ""Enwere m nwaanyị mụ na ya bụ ezigbo enyi kemgbe afọ asaa! Ike ịjikọta onwe gị dị mkpa, mana gbasara m, onweghi ihe gbasara m n'ịjikọta onwe m maka na onweghị ihe ọjọọ anyị abụọ bu n'obi. Johnson kwuru sị ""ọ bụ ihe nwere ike ime, mana ọ na-ara ezigbo ahụ ijide onwe gị"" Nathaniel Wilcox Thompson kwuru sị: ""nwoke na nwaanyị nwere ike ịbụ enyi na-enweghi Ihe jikọrọ ha dị mmekọahụ n'eziokwu. Ọ dịkwa Ka mụ onwe m na-arụ ọrụ na gọọmentị, enwere ọtụtụ ndị inyom mụ na ha dị na mma nke ukwuu mana enwebeghị mgbe anyị nwekọara mmekọ."" Ndị otu ihe ma ọ bụ abụọ kwụsịrị ha Ụfọdụ kwuru na ị nwere ike ịchọ ka ihe ọzọ jikọọ gị na ezigbo enyi gị, mana ị cheta na ihe nwere ike imebi ma ọ bụ na gị na onye ahụ nwere ike kwụsị inwe mmekọ n'ụzọ ọbụla, ị kwanyere onwe gị ugwu ma tụgharịa uche gị. Uchenna Ezihe kwuru sị ""Enwere m ọtụtụ enyi nwaanyị na-enweghị ihe jikọrọ anyị, mana ama m na ọ bụ nanị ọbere akara na-ekewa ('ezigbo enyi', 'enyi ihe ọzọ jikọrọ gị na ya', na 'mmekọrịta nwoke na nwaanyị'). A na m enye onwe m ezigbo ohere, maka achọghị m imebi enyi dị n'etiti mụ na ha."" Emedolibe Ngozi Emeka kwuru sị ""Ụfọdụ oge, ewu na-akwanyere onwe ya ugwu ma ọ nọrọ n'ọba"" Kedụ ihe dị mkpa n'ime enyi? Ụfọdụ na-abanye n'ime enyi maka na ha chọrọ onye ga na-eche echiche dịka ha, ụfọdụ chọrọ onye ga na-agwa ha eziokwu, etu onye ya na ha nwere mmekọrịta nwoke na nwaanyị agaghị esi agwa ha. Ndị ọzọ chọrọ onye ga na-agba ha ume etu pụrụ iche. N'agbanyeghi ụdịrị enyi dị n'etiti nwoke na nwaanyị, ọ na-adị mkpa ịmata ma unu abụọ akwụkwa n'otu akụkụ. Kedụ ndị ga-erite akụ nwoke ma ọ nwụọ?" media-45324953,https://www.bbc.com/igbo/media-45324953,APC na-achị na gọọmenti okpuru ọchịchị niile n'Imo steeti,APC na-achị na gọọmenti okpuru ọchịchị niile Imo steeti,"N'Imo steeti, eduola mmadị iri abụọ na asaa iyi ọrụ dịka ndị isioche gọọmenti okpuru ọchịchị nke steeti ahụ. Cheta na ụnyaahụ, ngalaba ntuliaka kpọrọ aha ndị meriri na ntuliaka ọchịchị ime obodo iri abụọ na asaa dị na steeti ahụ nke ha haziri na Satode agbanyeghị na pati ndị ọzọ esonyeghị mee ya bụ ntuliaka. PDP ebidola ire akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017 Otu PDP amala ọkwa mmalite ire akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị nke a kpọrọ 'Nomination forms maka ntuliaka 2019. Akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị gụnyere nke ọkwa onyeisiala, gọvanọ, ụlọomeiwu ukwu(Senate) ụlọomeiwu nke nta(House of Rep), ụlọ nnọchiteanya nke steeti(House of Assembly.) Trump o sị na ndụ afọghị n'ime Buhari? Onyeisiala Amerika bụ Donald Trump ekwuola na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ ""onye ndụ adịghị n'ahụ,""na ya achọghị ka ya na-ụdịrị mmadụ dịka Buhari nwe nzụkọ ọzọ. Ụlọọrụ akụkọ Financial times dere nke a kwuru na Trump gwara ndị ọrụ ya nke a oge ya na Buhari nwere ọgbakọ n'ọnwa Epreelụ. Akụkọ a pụtara taa na-ewu na soshal midia mana onweghị ọsịsa Buhari nyere maka ya. Pope Francis ọ ga-ede akwụkwọ arụkwaghị m? N'Afrika, otu ụlọọrụ na mba Kenya na-akpọpụta ụmụnwanyị niile na-ebo ndị ụkọchukwu ebubo na ha tụwara ha ime ka ha bịa mee nyocha n'aka ha iji chọpụta ma ebubo ó bụ eziokwu. Nke a na-eme dịka ka onyeisi ụka Katolik bụ Pope Francis jụnyụrụ anya ikwu maka onye kwuru ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm maka ebubo na ọ mara otu ụkọchụkwụ na-emetọ ụmụnwata. Craig Levein agaala ụlọọgwụ Craig Levein bụ aka na-achịkọta otu bọọlụ Hearts nọ ụlọọgwụ ugbua mana ndị ọrụ ya kwuru na- ọ na-agbake. Ha ekwughị ọrịa buru ya gawa ulọọgwụ. N'akụkọ yiri ya, Man United na Tottenham ga-asọmpị taa n'asọmpị iko Premier League. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Nwaanyị ji egwu agwụọ ọrịa Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia" afirika-43750156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750156,Arsenal egosila CSKA Moscow onye bụ dike,Otu Arsenal eruola ọkara ịkpeazụ n'asọmpị Europa League na mmeri ha mmeri CSKA Moscow.,"Danny Welbeck enyeela goolu atọ n'ime asọmpị abụọ N'asọmpị agbara ụnyahụ, ha gbara ọkpụ abụọ abụọ, mana na nchịkọta goolu ha Arsenal jiri ọkpụ isi ha satara atọ wee merie CSKA Moscow. N'otu CSKA Moscow, Fyodor Chalov na Kirill Nababkin bụ ndị nyere goolu na nkeji iri atọ na itoolu na nkeji iri ise. N'otu Arsenal, Danny Welberk na Aaron Ramsey bụ ndị nyere goolu na nkeji iri asa na ise na nkeji iri itoolu na abụọ. Mohamed Elneny onye Arsenal bu onye a kpọrọ nwoke kachasị gba bọọlụ n'asọmpị a Ihe ị kwesiri ị ma maka Arsenal na asọmpị Europa Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48957553,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48957553,Ruga Settlement: Ihe asaa dị ọkpụrụkpụ Ralph Uwazuruike kwuru butere ụka,Onyendu otu 'Biafra Independent Movement (BIM)' bụ Ralph Uwazuruike azaala ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ oku ha kpọrọ maka okwu gbasara Ruga.,"N'abalị Wenezde, Uwazurike gbara ama na ndị DSS ziteere ya ozi n'ekwentị ya sị ka ọ bịa hụ onyeisi ha n'isi ụlọọrụ ha n'Owere, Imo steeti. A na-eche na oku ahụ metụtara ozi Uwazuruike wepụtara n'ihe onyonyo ebe ọ kpọrọ Ndị Igbo oku ka ha gbakọta ọnụ jụ atụmatụ 'ruga settlement.' Mgbe BBC Igbo kpọrọ Uwazuruike iji mata ije ya na ndị DSS, Ọ saghị ekwentị ya nke o ji asa ozi anyị zigara ya. Mana ọnụ na-ekwuru otu BIM bụ Chris Muochia gwara BBC Igbo sị na Uwazuruike gara zaa oku a kpọrọ ya. Mana o kweghị ekwu ihe Uwazurike na ndị DSS kpara. ""Ọ bụ Uwazuruike na onwe ya nwere ike ịgwa unu ihe ya na ndị DSS kpara."" ""Ọ bụrụ ihe ndị ọzọ gbasara otu anyị, aga m azali gị ya."" 2019: E ji Ndigbo eme akaje Ihe asaa dị ọkpụrụkpụ Uwazuruike kwuru butere ụka N'ihe onyonyo nke Uwazuruike wepụtara n'intanetị ọ sịrị na o teela ya ji ama ọkwa ihe ndị dabidoro Ndị Igbo na Naijiria ugbua. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru: 1. ""Mmiri na-achọ ịma Ndị Igbo."" 2. Ọ rụtụrụ aka na ""Nsogbu Ndigbo nwere bụ ndị na-achị ha - ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ na ndị ndu Ohaneze."" ""Anyị ga-edulata nna mụrụ Nnamdi Kanu"" - Ikpeazu 3. ""Buhari pụtara sị na ya akwụsịla ruga, otu nwatakịrị ha zinyere pụtara nye iwu."" 4. Onyeisi Ohaneze pụta sawa nwatakịrị okwu, onyeisi ndị ọhaneze na-asa ya, ọ maghị na o nwere ndị zigara nwata ahụ. Nwa nza nọ na-agba egwu, o nwere ihe na-etiri ya egwu."" Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa 5. Uwazuruike tara ndị ndu Ohaneze ụta sị ""Nzụkọ ole ka ị kpọrọ Ndigbo tupu ị sị ha zọwa onwe ha."" 6. ""Naijiria ga-ekewa mana ọ bụghị site n'ọbara Ndigbo."" 6. ""O nweghị ihe dịka 'restructuring'. Mmezi okwu gbasara Naijiria bụ Naijiria ikewa, onye ọbụla agawara onwe ya."" 7. ""Nsogbu Naijiria enweghị mmekwata.""" afirika-44927574,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44927574,Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Amerịka na Iran a ga-aga agha?,Ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe na-eme ngagharị iwe maka ọnwụ otu onye n'ime ha bụ Francis Mmadubuobi.,"End of Twitter post, 1 Iwe ha bụ na ụlọọgwụ nke ụlọakwụkwọ ha agbataghịrị Francis ọsọ enyemaka oge ha bugara ya ebe ahụ mgbe ọ tụbọrọ. Francis kwesiri ide ule ikpeazụ ya taa wee nwụọ ụnyaahụ. Ndị agha Naịjirịa Onyeisi ndị agha ụgbọelu Naịjirịa bụ Sadique Abubakar ekwuola na ha bụ ndị agha na-eme ihe niile dị n'ike ha ịhụ na e meriri agha ha na ndị Boko Haram. Cheta na ndị n'eyi ndụ egwu bụ Boko Haram wakporo ụlọ okpukpe ndị alakụba n'ụzụ ụtụtụ taa mgbe ha na-ekpe ekepere. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisiala ibe ya nke Iran bụ Hassan Rouhani na-ama aka. Rouhani kwuru na Amerịka chọọ ilụso Iran ọgụ na ọ ga-abụ agha ọkaibe mana Trump sara ya sị na ha ga-ata ahụhụ dịka ibe ha tara ma ọ majaa Amerịka ọzọ. Akụkọ na-eru anyị ntị n'egwuregwu ugbua na-ekwu na onyenkuzi otu egwuregwu bọọlụ Enyimba esila n'ọkwa ya ritue. Paul Aigbogun bụkwa onyenkuzi otu Naịjiria bụ Flying Eagles kwuru na ọ bụ ihe masiri ya ka o ji kpebie ya bụ ihe. Gee nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-43194332,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43194332,Gọọmenti akagbuola nzukọ FEC nke izuụka a,Agaghị eme nzukọ ndị ọchịchị Naịjirịa a na-akpọ 'Federal Executive Council' (FEC) nke izuụka a.,"Onyeisiala Buhari bụ onye isi ndị ọchịchị so na FEC Onye na-ekwuchịtere onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina gwara ndị ntaakụkọ taa,na onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari na ọtụtụ mịnịsta ya ga- eje mmeme a ga-eme na Transcorp Hotel dị na Abuja na Wenesde bụ ụbọchị ekwesiri ime nzụkọ a. Adesina kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụru sị,""Nzukọ FEC agaghị adị na ụbọchị Wenesde, ọnwa Febụwarị 28, nke afọ 2018."" Nzukọ FEC bu ebe ndị ọchịchi na anọ ahazị ọchịchi obodo ""Ọ bụ maka na onyeisiala na ndị mịnịsta ya nwere nnukwu mmeme nke a kpọrọ 'International Conference on Lake Chad Basin,' n'ụlọ nkwari, Transcorp Hilton, dị n'Abuja. Ha ga-anọ ogologo oge ebe ahụ."" Ndị ọchịchị gọọment a na-akpọ FEC na-agbakọ kwa Wenesde n'Abuja. Ndị na-eso na ọgbakọ a bụ ndị mịnịsta, ndị gọvanọ na ndị chibụrụ Naịjirịa dị ka onyeisiala. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-51788459,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-51788459,Coronavirus: Mmadụ 22 enyochara ebughi ọrịa ahụ na Naịjirịa - NCDC,NCDC ekwuola na n'ime mmadụ 23 e mere nyocha na o nweghi onye ọzọ bu ọrịa Coronavirus na Naịjirịa n'abụghị nwoke onye bu ya mbụ.,"Nke a na-abịa dịka ha lebara anya n'ahụ mmadụ 22 ọzọ si na steeti ise na Naịjirịa gụnyere Legọs, Ogun, Abuja, Kano nakwa Edo. Ha kwuputara site n'akara Twitter ha na ""o nweghi onye ọhụrụ ọzọ bụ Coronavirus"" End of Twitter post, 1 Ndị njem ụgbọelu ka na-eme njem agbanyeghi mmachi a dị Mba Ịtali etinyela mmadụ nde iri na isii n'ọnọdụ Bekee kpọrọ ""quarantine"" dịka ọ na-ebuso nje coronavirus agha ịhụ na ha chabiri mbawanye ya. Ndị o metụtara bụ ndị bi na mpaghara Lombadi nakwa mpaghara 14 ọzọ. Ndị a niile ga-anata akwụkwọ pụrụiche tupu e nye ha ohere ka ha mee nje ọbụla. Obodo Milan an Venice so n'ebe ya bụ ihe metụtara. Onyeisiala Ịtali bụ Giuseppe Conte kwukwara na ha amachiela ndị mmadu ịga ụlọakwukwọ, ebe oriri na nkwari nakwa ebe njem nkiri di na mba ahụ dum. Ndị kwụ n'aghịrị na ebe a na-ere ihe dịka ozi ""quarantine"" pụtara Ọ bụ n'ụbọchị nke atọ nke ọnwa Eprelu ka mmachị ndị a ga-akwụsị. Mba Ịtali b ya kacha nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Yurope. Olu onye Naịjirịa nọ na China na-ekwu maka ihe ha na-agabiga n'ihi Coronavirus Ndị ọchịchị kwuru na ndị bu nje a na-abawanye kwa ụbọchị. Ugbua, ihe ruru mmadụ 5,883 bu ọrịa coronavirus na Ịtali ebe mmadụ 230 anwụọla. Gịnị mere Gọvanọ Hope Uzodinma? Akụkọ na-efegharị na-akọwa na a wakpoola ụgbọala Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma na steeti ahụ. Ụlọ ntaakụkọ dị icheiche kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa Ohaji - Egbema wakporo Uzodinma ma na-ati ""Onye oshi vootu"" Ebe akụkọ ọzọ na-ekwu na ndị ntorobịa na ndị agha lụrụ ọgụ nke butere mmebi enyo ụgbọala Gọvanọ Uzodinma. Ka ọ dị ugbua BBC Igbo na-agba mbọ ịchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ a. N'egwuregwu, Chelsea ji ọkpụ goolu anọ asataghị otu yọchaa Everton ka akamụ ndụ mgbe ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig n'ụbọchị ụka. Nke a na-abụ ugboro abụọ Lampard onye nchịkọta Chelsea na-emeri ndị nkuzi ya bụ Ancelotti na Mourinho. Amachiela ndị mmadụ ịga kirie asọmpi egwuregwu dị icheiche na mba Itali Coronavirus metụtakwara egwuregwu na mba Ịtali. Ndị nhazi egwuregwu kagburu asọmpi niile gaara adị n'izuụka gara aga n'ihi ya bụ ọrịa. Etu ahụ ka ọ dịkwa n'egwuregwu bọọlụ nkata na ndị ọzọ. Mana ha enyela iwu ugbua ka asọmpi ndị ahụ gaa n'ihu, kama onweghị ndị mmadụ ga-abịa ikiri ya. Coronavirus n'Afrịka Okammụta Oyewale Tomori Ọkammụta n'ihe gbasara nnyocha nje bụ Oyewale Tomori ekwuola na onye ọbụla sị na ya nwere ọgwụ maka coronavirus n'Africa bụ okpotokpo asị ka ọ na-asị. Tomori onye bụbu onyeisi mahadum Redeemers dị n'Osun steeti kwuru nke a dịka akụkọ na-agbasa ebe ụfọdị ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere ọgwụgwọ maka ọrịa a. O kwuru na ọ bụrụ na e nwere mba ga-ewepụta ọgwụ coronanavirus, o kwesịrị ịbụ mba Chaịna ebe ya bụ ọrịa nọrọla ọtụtụ oge. Tomori jụrụ sị, ""kedu ka mmadụ ga-esi kwuo na ya nwere ọgwụ maka ọrịa batara Afrịka n'otu izuụka gara aga?"" ""Tupu mmadu ekwuo na ọgwụ na-agwọ ihe, ọ ga-egosi anyị onye o ji ọgwụ ahụ gwọọ."" ""Ndị kwuru na ha nwere ọgwụ coronavirus, mmadụ ole na-arịa ọrịa a ka ha gwọrọla?"" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Amputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'" afirika-50358134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50358134,Under-23 Nations Cup: Ụmụ Naịjirịa ji ọnyụpa malite iko mba Afrịka,Aka wụrụ ụmụ Naịjirịa ndị 'under 23' n'isi taa.,"Ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa ndị 'under 23' Ọnyụpa ka ha ji malite asọmpi iko mba Afrịka maka ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ. Ọbụkwa asọmpi a ka a ga-eji họta ndị ga-aga egwuregwu 'Olympics' nke afọ 2020. Ha na ndị Ivory Coast zutere onwe ha taa n'egwuregwu mbụ ha na ya bụ asọmpi. Mana ha agbataghị ọnụ ha n'ihi na Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu kọwaara ha ihe ọkụ ji ntị oke eme. Penariti ka Silas Gnaka ji gbakaa neetị na nkeji 71 n'egwuregwu ahụ. Ọbụ Olisa Ndah gbaturu mmadụ n'ihu goolu nke mere e ji nye ya akwụkwọ ọbara ọbara ma gbaara ya ụgbọnwamkpi. Naịjirịa nọ n'otu 'B' n'asompi ahụ. Ndị ọzọ nọ'notu ahụ gụnyere Ivory Coast, Saut Afrịka, na Zambịa. Buharị na-arọ 'third term' anya Femi Falana Okaiwu e ji nkwalite ikike dịịrị onye mara bụ Femi Falana ekwuola na ọ na-adị ya ka onyeisiala Buharị ọ na-akpa nkata ịchị Naịjirịa nke ugboro atọ. Falana gwara BBC na mmekpa ahụ niile a gọọmentị etiti na-emekpa ndị ntaakụkọ bụ iji mee ka ụjọ ghara ikwe ha kwuo ihe ọbụla mgbe ha ga-amalite atụmatụ 'third term' ha bu n'obi. Ndị Dọkịta Zimbabwe Ndị dọkịta na-eme ngagharịiwe na Zimbabwe Mba Zimbabwe achụọla ndị dibia bekee ruru narị abụọ n'ọrụ n'ihi ngagharịiwe ha na-eme iji kwuo ka e bulie ụgwọọnwa ha. Gọọmentị Zimbabwe kwuru na ha enweghị ego ọbụla iji buliere ndị dọkịta ụgwọọnwa. Ndị dọkịta na-ewe iwe na ego a na-akwụ ha enweghị ihe ọbụla ọ na-ezuru ha. Nke a bụ maka oke ihe isi ike dị na Zimbabwe ugbua. Ihe a na-akwụ ndị dọkịta zimbabwe ugbua erughi otu narị dọla. Oruola tanka anọ dara n'Anambara n'ime izuụka anọ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed sị na gwomgworo bu mmanụ ụgbọala dara n'ụzọ Zik dị n'Ọka bụ isi obodo Anambara steeti n'elekere asaa nke ụtụtụ taa. Maazi Mohammed sị na ndị ọrụ ha nakwa ndị ọrụ gbata gnata ntịnyụ ọkụ nọ n'ogige ihe a mere. ""Anyị na-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ abanyeghi iku mmanụ a, ma hụ kwa na onweghị ihe mberede ọbụla si n'ihe mere pụta. Nke a na-eme ihe ruru gwomgworo anọ dara n'Anambara n'ime izuụka anọ. Iwu ọhụrụ Gọvanọ Willie Obiano hibere kwesiri ịkụsị Gwomgworo ịgba n'ehihe n'Anambara Nke mbọ batara n'akụkọ BBC Igbo bụ nke butere ọkụ ọgbụgba ahaịa Ọchanja. Gọọmentị Anambara ji maka oke ọdụda gwomgworo a manye iwu ka ha gharị ịgba n'ehihe. Ọchịchịrị gbara n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghi ọkụ afọ ruo afọ Nwanne i nwere ọkụ latrik n'ogbe gị? Ọ bụrụ na i nweghi ọkụ mara na ọ bụ n'ihi nsogbu igwe ọkụ nwere na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa. Akụkọ na-ekwu na steetị ndị nke a metụtara gụnyere Legọs, Abuja, Kano nakwa ọtụtụ ebe ndị ọzọ. N'ofesi Ụlọikpe kachasị na mba India a chabiela ikpe sị ka e were ala nsọ a kpọrọ Ayodhya dị na mpaghara ugwu India nye ndị okpukperechi Hindu. Ndị okpukperechi Hindu na ndị Alakụba na-azọ oke ala nsọ kamgbe ọtụtụ iri afọ gara aga. Adajọ ti tu Soworẹ silẹ Ụlọọrụ nchekwa DSS sị n'ezie na ha anatala iwu sị ka ha tọhapụ Omoyele Sowore kama na o nwebeghi onye bịara ịkpọrọ ya. Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wepụtara n'ụbọchị bụ abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2019. Ọ sị na ha agwala ụlọikpe nyere iwu a na-onwebeghi onye bịara sị na ọ chọrọ ịkpapụta Sowore. Afunanya gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha abụghị nke na-enupuisi n'iwu ụlọikpe nyere. Mana ọkaiwu Sowore bụ Femi Falana gwara BBC nwanne ụnyaahụ na o zipụla ndị ọrụ njem ịkpọlata nwa amadị ahụ. Falana kwukwara na ya ga-agba DSS akwụkwọ maka ha emeghị ihe ụlọikpe sị ha mee. Ego e ji arụ ụzọ dị obere - Ụlọomeiwu nta Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari Kọmiti ụlọomeiwu nta na-ahụ maka okporoụzọ sị na ijeri naịra iri abụọ na itoolu amawapụtara maka ịrụzi ụzọ agaghị ezu n'ihi ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ Naịjirịa dị. N'otu aka ahụ, pati anọghị n'ọchịchị bụ PDP sị ka mịnịsta na-ahụ maka ọrụụzọ bụ Babatunde Fashola rịtuo n'ọkwa n'ihi okwu ha si na o kwuru maka ọnọdị okporoụzọ. N'ofesi A tọhapụla onye bụbu onyeisiala mba Brazil bụ Luiz Inacio Lula da Silva dịka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa iri na asatọ n'ụlọ mkpọrọ. A tụrụ Lula mkpọrọ n'obodo Curitiba n'ihi ebubo nrụrụaka. Ọkaikpe sị ka a tọhapụ ya ma nye ya ohere ị gaa n'ụlọikpe mkpegharị ga zara ọnụ ya. Chelsea apịawaala Crystal Palace azụ Tammy Abraham nyetaara Chelsea goolu. Ndị otu egwu bọọlụ Chelsea na-achakezi ka kpakpando ugbua. Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji pịawaa ndị Crystal Palace azụ na mgbede Satọdee. Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyere Chelsea mmeri. Frank Lampard bụ onye nkuzi bọọlụ bụ ọkaibe n'ọnwa Ọktoba Chelsea emeriela asọmpi isii ikpeazụ ha gbarala. Nke a mere ka e tunye onye nkuzi ha bụ Frank Lampard ugo dịka ọkaibe n'ọnwa October. Bayern chọrọ ịzụ Arsene Wenger Onye nchịkọta Arsenal n'oge mbụ bụ Arsene Wenger na otu egwuregwu Bayern Munich ga-enwe mkparịta ụka n'izuụka ọzọ maka iwere ọnọdụ dịka onye nchịkọta ha. Cheta na Bayern Munich chụpụrụ Niko Kovac onye jibu ọkwa onye nchịkọta ha n'izu a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri 'Agaghị m agbatịnwu aka m mana a ga m agbatịnwu ụbụrụ m'" afirika-45003820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45003820,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Okechukwu sị Ndigbo tinye uche na ịnweta ọkwa onyeisiala 2023,Onyeisi ụlọ mgbasa ozi Voice of Naịjirịa bụ Osita Okechukwu gwara ndị Igbo Leaders of Thought ha tinye uche ha na inweta oche onyeisiala Naijirịa na 2023 karịa ikwu maka ịhazigharị obodo Naijirịa.,"Igbo ekwuzila maka ịhazịgharị obodo Naịjirịa Osita Okechukwu bụ onyeisi ndị Voice of Naịjirịa Okechukwu kwuru na ị kwadọ onyeisiala Muhammed Buharị ga-enye Ndigbo ohere ị nwete ya bụ oche onyeisiala na 2023. Akụkọ maka Codiene apụtala ọzọ ụmụ ntorobia na aṅụbiga ogwu codiene oke Ministri na ahụ maka ahụike sị na ha ekpochapụla ọgwu ụkwara kodin ruru nde abụọ na ụma dị na ahịa na Naịjirịa. Okammuta Isaac Adewole bụ minista ahụike na Naijịrịa kwuputara nke a n'Abuja mgbe otu ehibere maka nyocha mkpamkpa ya bụ ogwu na-akpa bịara ị kọrọ ya ihe ha chọpụtara. Ọkụ na agba na Califonia Ọkụ na-agba ọzara na Califonia, US Ọ bụrụ na ndị nke gị nọ na Califonia mba US biko kpọọ ha jụọ ma ha apụtakwa n'ụtụtụ a maka oke ọkụ na-agba ọzara nke batara n'ala ahụ. Ihe dịka mmadụ atọ anwụọla n'aka ya bụ oke ọkụ nke ajọ ikuku mere ka onwusiwa ike kemgbe ụnyahụ. Egwu ahọọla Nemanja Matic Nemanja Matic bụ onye serbia na-agbara Manchester United N'egwuruegwu, Nemanja Matic bụ onye otu Manchester United agaghị eso gbaa bọlụ mbụ nke ndị otu ha na ndị Leicester city ga-akwata na mkpuru ụbọchị iri nke ọgọst. A kana eleta Matic anya n'ụlọọgwụ maka ahụ o meruru mgbe ọ gbara iko mba ụwa. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị" 53787536,https://www.bbc.com/igbo/53787536,Ọkọ ngada: Gịnị na-ebute 'Ọkọ Junction'?,Ọtụtụ mmadụ na-akọ ọkọ na ngada mana ha amaghị ihe na-akpata ya.,"O nwere ọtụtụ aha e ji mara ọkọ a nke gụnyere 'ọkọ Junction', 'Ọkọ tee', ' ọkọ achọrọ m ịma', dgz. Ọrịa ọkọ ngada nke a na-akpọ Jock Itch n'okwu bekee bụ ọrịa ọkọ na-ebute ahụ mgbakasị. Ọkọ a nwereike ọ bịa mgbe ha chọrọ ime ihe dị mkpa maọbụ mgbe ha nọ n'etiti ndi mmadụ. Akụkọ a ga-gwa gị ihe na-akpata ọkọ ngada, mgbochi ya na ọgwụgwọ ya. Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke BBC Igbo kpọtụrụ ọkammụta Uche Ojimma bụ ọkachamara maka ihe gbasara anụahụ mmadụ ma bụrụkwa onye isi Dermatologist Department nke University Of Nigeria Teaching Hospital. O tinyere ọnụ n'okwu a ma kụwa akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ ọrịa ngada. Gịnị bụ ọrịa ọkọ ngada maọbụ Jock Itch? Udiri nje fungus na-ebute ọrịa ọkọ ngada Dọkịnta Uche Ojimma kọwara na ọ bụ nje a na-akpọ dermatophytes na-ebute ya. Dermatophytes a sị n'ezinụlọ nje Bekee kpọrọ 'Fungus'. Ojimma kọwara na aha bekee ya bụ Jock Itch sitere ma bido dịka ndị na-eji ịnyịnya eme asọmpị a na-akpọ Jockeys na-ebute karị ya site n'ahụ ịnyịnya. Ya bụ ọkọ na-emekarị na ngada nwoke ma na-eme kwa ụfọdụ ụmunwaanyị. Ọ kọwara na ihe na-amasị nje Dermatophytes n'ahụ mmadụ bụ ceratin nke na-adị n'anụ ahụ, mbọ aka na ntụntụ isi. Ọ bụ ceratin a ka nje a na-eri. Kedụ ihe na-ebute ọkọ ngada? E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ si ebute ya bụ ọkọ ngada, kama otu ihe mmadụ kwesiri ịma bụ na ọdịda Afrịka ebe a na adịkarị ọkụ ma ikuku na-adị kwa mmiri mmiri nke a kpọrọ Humid na Bekee socha n'ihe na enyere aka ebute ọkọ ngada. Ọ bụ Dkt Ojimma kwuru nke a ma kọwa kwaa na ebe dị etu a na-eme ka ngada mmadụ nwee ọsụsụ ma di ọkụ. Ọ kọwara na ọ bụ ebe dị etu na-amasị nje Fungus nke na-ebute ọkọ ngada. Ọkọ ngada na-eme ka ahụ mmadụ na ekpecha ekpecha, ọ ga-akpọ nkụ ma na-acha kwa uhie uhie n'etiti ngada. Ojimma kwukwara na ọkọ a nwereike site na mbọ mmadụ ma fee na ebe ndị ọzo n'ahụ mmadụ. Ọ na-ebute oke ịkọ ọkọ na ngada, o nwereike site na ngada gafee n'ike mmadụ. Kedu etu esi egbochi ọkọ ngada 1) Ụgbọrọ ole ka ị na-eyi obante gị tupu ị saa ya? E nwere ndị na-asa obanta ha nanị mgbe o si were nsị. Dọkịnta Ojimma kwuru na ọ bụ nanị otu ugboro ka mmadụ kwesiri iyi obante ya Ọ kọwara na ọ dị mkpa mmadụ iyi obante nanị otu mgbe ma saa ya mmiri. Nke a agaghị enye nje dermatophytes ịmubanya n'ahụ mmadụ. 2) Lee kwa ma ọ bụ cotton ka eji mee obante gi Biko gbaa mbọ hụ na uwe ukwu gị bụ cotton ka ejiri mee ya Dtk Ojimma si "" Anytị na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-eyi uwe okpuru maọbụ boxer eji cotton mee"". O kwuru na nke a ka mma karịa mmadụ iyi 'Tight' nke na eme ka ọsụsụ na asụ mmadụ na ngada. Ojimma kwuru na obante eji cotton mee ka mma n'ihi na cotton ga amipụcha ọsụsụ ma nye kwa ohere ka ikuku na abata na ngada. 3) . . . Umunwaanyị kwanu? Biko hụ na ịba gị bụ cotton ka e jiri mee ya ma ya nwekwa ohere ikuku ịbanye Dkt Ojimma kwuru sị ""Ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-eyi ịba nwere ohere ikuku sị apụ ma nke e ji cotton mee"". O kwukwara ka ụmunwaanyị na eyi obante ha nanị otu ugboro. Ojimma rụtụkwara aka na ọ dị mkpa ka ha na-asa ahụ ha oge niile. 4) Ozughị nanị n'ịsa obante gị Dkt Uche Ojimma kwuru sị "" Onye sachaa obante ya, ya were igwe iron dakpọọ ya"". Ọ kọwara na nke a ga-eme ka ọkụ si n'igwe Iron gbuo nje ọ bụla nwereike ị nọ n'ọbante. 5) ị na-eyi uwe ukwu maọbụ trauza mmadụ? Biko eyizila uwe ukwu mmadụ ọzọ maọbụ trauza ya. Ojimma kọwara na akpụkpa ahụ onye ahụ nwereike i site na trauza onye ahụ banye na nke onye ọzọ. Ọ kọwara na nke a bụ otu uzọ ọkọ ngada sị efesa. 6) ""Biko, nye m tọwel gị ka m were hichaa ahụ"" Biko sị mba! Dkt Ojimma kwuru na mmadụ iji akwa eji ehicha ahụ nke mmadụ ọzọ bụ etu ọzọ esi ebute ọrịa ọko ngada. O kwuru ka ọ bụrụ nanị otu onye ga-enwe akwa eji ehicha ahụ ma na sa kwa ya oge o kwesiri. 7) Ị dịna n'otu akwa Ụfọdụ mgbe, onye nwere ọrịa ọko ngada kọchaa ọko, akpụkpa anụ ahụ ya nke bekee kpọrọ ""scales"" nwereike dasa n'elu akwa. Mgbe onye ọzo dịnara na ya bu akwa, akpụkpa anụ ahu a banye ya na ngada, onye ahụ nwereike ibute ọrịa ọko ngada. 8) Aramara! Eeeeee! Dkt Ojimma kwuru sị ""Onye nwere ọkọ ngada nwereike ibunye onye ọzọ ya bụ ọrịa ma ha abụo nwee mmekọ. Ọkọ 'junction' na-ara ahụ ịgwọ. E nwereike iji ntule chọpụta ya kama ọ dị mkpa ka mmadụ gaa ụlo ọgwụ maka nyocha. Ọkọ ngada o nwere ọgwụgwọ? Dkt Ojimma kwuru na ọgwụgwọ ọrịa ọkọ ngada na-esi ike ma na-akarị kwa otu ọnwa. E nwere ọtụtụ ọgwụ eji agwọ ya nke a na-akpo anti-fungal. E nwere nke a na aṅụ aṅụ ma nke a na-ete n'ahụ. Ndụmọdụ Dkt Ojimma gwara ndị mmadụ bu sị "" idị ọcha dị oke mkpa, biko yie ịba gị nanị otu mgbe"". Gbam! Akụkọ ndị ga-amasị" mba-uba-43525074,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43525074,Otu nwaanyị egbuola ụmụ ya ise,"Ụlọikpe mba France tụrụ Romana Canete, onye dị afọ ịrị atọ na asaa, mkpọrọ maka iji mmiri gbagbuo ụmụ ya ise oge ọ mụrụ ha ọhụrụ ma tinye igbe njụoyi nke a kpọrọ 'freezer' na bekee.","Chavigne kwuru na nne ahụ nọ na nnukwu mmekpaahụ nke obi Canete , onye na-ebe akwa na arịọ mgbaghara n'ụlọikpe na Bordeaux, dị na ọdịda-anyanwụ France kwetara na ya mụrụ nwa n'ime ihe eji asa ahụ ma hapụ ụmụaka ahụ ka ha nwụọ n'ime mmiri. Mgbe nwaanyi ahụ na-ekwu okwu n'ụlọ ikpe, o ji anyamiri sị: "" Na mbụ ana m arịọ ụmụaka ọhụrụ m ka ha gbaghara m. Aga m enwe ike ịga n'ebe a na-eli ozu ma pụta na mkpọrọ gai rịọ ha mgbaghara. ""Ana m arịọkwa mgbaghara n'aka ezinaụlọ m, ụmụ ndị nwaanyị ndị bị na-edi ihe ụfụ nke a."" O kwukwara sị: ""O nweghị ihe ọzọ m hụrụ mee. A chọghhị m ime ndị ahụ. Mụọ m juru ụmụaka ahụ."" Ọ bụ otu n'ime ụmụ Canete abụọ na-eto eto hụrụ nwa ekechiri n'ime aka nime igbe njụoyii. Dịka akwụkwọ akụkọ AFP siri kwuo, ndị uweọjịị mechara hụ ọzu ndị ọzọ ka di nwaanyị ahụ kpọchara ha. Nchọpụta a pụtara ihe n'ọnwa Maachị afọ 2015, ma Romana anọla afọ atọ na mkpọrọ. Akụkọ kwuru na ọmụmụ na ọgbugbu ụmụaka ndị ọzọ mere afọ iri tupu nke chịpụtara nwaanyi ahụ ụkwụ n'ama. A na-ele anya na nwaanyị ahụ agaghị anọcha afọ asatọ n'ụlọnga, na ọ ga-anọ afọ ise n'aka ndị nlekọta ma a tọhapụ ya. Di ya bụ Juan Carlos, onye ọrụugbo,kwuru na ya amaghị ma ọlị na nwunye ya dị ime ndị ahụ. Ndị ọkachamara kwuru na ọkaikpe kọwara nwoke ahụ dịka onye nwere 'oke ekworo' na ebe nwunye ya nọ. Onye kpere ikpe ahụ bụ Xavier Chavigné, kwuru n'ikpe ahụ lebara anya n'ụdị mmadụ di nwaanyị ahụ bụ. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-44343242,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44343242,England Vs Naịjirịa: Ihe ndị Naịjirịa na-atụ anya,"N'ime nkwado asọmpi Iko Mba Ụwa nke Rọshịa 2018, ndị Super Eagles nke Naịjirịa ga-ezute ndị Three Lions nke England taa.","Super Eagles so na ndị kachasị obere n'afọ n'ime otu bọọlụ mba ụwa niile na-abịa asọmpi nke Rọshịa 2018 Super Eagles bụ ndị kachasị obere n'afọ n'ime otu bọọlụ mba ụwa niile na-abịa asọmpi nke Rọshịa 2018. I ji mee ka ha kwụrụ chịm n'izute otu bọọlụ chere ha n'ihu, ha malitere asọmpi enyi ne enyi bụ ebe ha ga-ezute mba England taa. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa e gosila nkwado ha n'ebe Super Eagles nọ ma kwuo ihe ha na-atụ anya n'ime asọmpị ahụ. Ha kwuru nke a site n'akara twitter ha dị iche iche; Kayode Ogundamisi kwuru na ọ ga-akwado Super eagles imeri agbanyeghi na ọ hụrụ England n'anya. Richard Moneme kwuru n nkwado enyerela ndị Super Eagles dị ukwuu ya mere ha kwesiri ime nkeọma Ebuka Obi-Uchendu kwuru na ọ ga ghanyere ndị England aja na garri dịka ọ ga anọ n'ọgbọ egwuregwu Wembly dị na Lọndọn N'aka nke ọzọ, ndị mba England kwadokwara otu bọọlụ nke ha n'inwe mmeri Ed Shaw kwuru na England ga-eji ọkpụ ise asatara atọ merie Naịjirịa. Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu" 44206958,https://www.bbc.com/igbo/44206958,Lee webụsaịtị ndị ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjịrịa e ji nde naịra 64 wee hazie,Ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjirịa kwuru na ha ji nde naịra 64 n'ọma wee hazie webụsaịtị ha bụ www.osgf.gov.ng.,"Odeakwụkwọ ahụ bụ Boss Mustapha kwuru na ihe ụlọọrụ ahụ na-arụ na Naịjirịa kwesiri ha inwe webụsaịtị pụrụiche ga-egosi ọrụ ha. Mustapha kọwara na etu webụsaịtị ahụ dibu na mbụ egosighi ọkwa ụlọọrụ ahụ. Mana ihe a abọliela uzu n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ dịka ha na-ajụ ụdị webụsaịtị a ga-eji ụdị ego ahụ rụọ. Ụmụ Naịjirịa nọ na twitter kwuru uche ha na etu o si emetụta ha. Damilola na-ajụ ụdị webụsaịtị a ga-eji ụdịrị egọ ahụ wee rụọ, na-ekwu ka a kọwara Naịjirịa etu e si mefuo ego ahụ. N'akụkụ nke ya, Segun Joseph kwuru na ọ dịka ụdị webụsaịtị a anaghị eji ego data tupu e mepee ya. Ọ dịka o juru Olawale Adetula anya maka na ọ na-ajụ ka ọ bụ webụsaịtị a ka e ji nde naịra 64 we hazie. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45244000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45244000,Ozubulu: Ndị uweojii anwụchiela Ezemmụọ Ndekwulu gbara aja,Egwu dị n'Ozubulu bụ isi ọchịchị obodo Ekwusigo dị n'Anambara steeti n'ihi nnwụchi ndị uweojii nwụchiri ezemmụọ Ndekwulu maka ị gọ ọfọ.,"Eze mmụọ aha ya bụ Anazo Ilomuanya bụ onye e kwuru gọrọ ọfọ ma bụọ ndị niile aka ha dị n'ogbugbu ndị Ozubulu na Naịjirịa nakwa mba Saụt Afrịka ọnụ. Ndị ọzọ a nwụchiri gụnyere Emeka Anaekwe, Okoli Udegbunnam, Ifediora Aloysius na Igbokwe Nnanyeleze. Akụkọ kwuru na ndị ntoroọbịa a kpọrọ 'Concerned Indigenous People of Ozubulu' na bekee, chọrọ ụzọ a ga-eji kwụsị ogbugbu ụmụafọ Ozubulu na-aga n'ihu kemgbe otu afọ ọ malitere. Ha nwee mkpebi ịga n'ihu arụsị Ndekwulu, mana mkpebi a adịghị ndị obodo mma n'obi nke mere ha ji kpọọ ndị uweojii. Ndị uweojii bịara ebe ahụ ma nwụchie Ezemmụọ arụsị Ndekwulu bụ Anazo Ilomuanya dị afọ iri itoolu na anọ nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ. Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Muhammed ajụjụ, o kwuru na nke a bụ eziokwu. Muhammed kwuru na dịka ọ dị ugbua na akpọpụla Ezemmụọ arụsị Ndekwulu na ndị ọzọ anwụchiri n'ụlọikpe ebe aga-egbe ha ikpe. Akụkọ kwuru na ndị akpọrọ aha n'ihu arụsị Ndekwulu gụnyere ndị uweojii, ndị Ozubulu a na-ekpe ikpe na ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ, ndị ọkaikpe ji ikpe Ozubulu nakwa ụfọdụ ndị ndu obodo Ozubulu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọkụ ogene" afirika-50402458,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50402458,Ihe ise ndị nwere ikpu kwesiri ịma,"Enwere ọtụtụ ihe ndị na-abụghị eziokwu maka ikpu nwaanyị, na-efegharị n'elu soshal midia mana otu nwaanyị aha ya bụ dọkịta Jen Gunter na-agba mbọ ịmezi ya.","Gunter bụ dọkịta na-ahụ maka ụmụnwaanyị di ime na US na Canada katọrọ atụmaatụ kwuru na a ga-etinyenwu akwa n'ikpu maka ihazị nsọ nwaanyị maọbụ ijide ebe nwaanyi si anyụ mamịrị. Gunter depụtara ụfọdụ ihe o chere ndị nwere ọtụ kwesiri ịma ka aghara ị lafu ha. 1. Chọpụta ndịche dị n'etiti ọtụ na ọnụ ọtụ Gunter kwuru na ọtụ dị n'ime ahụ ebe nke na-emetụta akwa gị bụ nke a na-akpọ ọnụ ọtụ. O kwuru na ọ dịmma ka ụmụnwaanyị nakwa ndị mmadị na-akpọ okwu aha karịa ma ị na-akpọ ọtụ aha nkwuchi. Nke a ga-eme ka amara nke bụ nke ma ị ga ikpesara dọkịta nsogbu gbasara ya. 2. Ọtụ na-ehicha onwe ya Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-eche karị na ị ga-eji ncha dị iche iche wee sapụ ọtụ gị mana o kwuru nkea abụghị eziokwu. O kwuru na ọtụ bụ ime ụlọ na-ehicha onwe ya. A ga-ejinwu mmiri wee sachapụ ọnụ ikpu. 3.Ọtụ nwaanyị dịka ogige flawa Ọtụ nwere nje ndị dị mma n'ime ya maka ichekwa ya dịka Gunter si depụta. O kwuru na ụmụ nwaanyị ekwesighị iji ihe e ji akpọ ihe nkụ abịa n'akụkụ ọtụ. 4. Aji ọtụ nwere uru ọ bara Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-ejikarị agụba akpụchapụ aji niile dị n'ọtụ ha. Nke a dị mma maka iwepụ igwu n'ọtụ mana o nwere ọgbata uhie so ya. Ogbatauhie so ya gunyere nyewa ahụ nakwa nje ibanye n'ime ikpu. 5. Nka na-emetụta ọtụ Ka nwaanyị mụchara nwa, kwụsị ihụ nsọ ya, ihe dị n'ahụ ya mere ka ọ mụnwoo nwa e belata. Nke a na-emetụta ọtụ na ọnụ ọtụ site n'ime ka ọ kpọ nkụ ghara ị na-atọzi nwaanyị ụtọ. Gụnter nyere ndụmọdụ ka ụmụ nwaanyị hurụ onwe n'ọnọdụ a gaa hụ dọkịta ka onye ga-enye ha mmanụ ga-eme ka ọtụ ha ghara ịkpọ nkụ. ""O dị mkpa ka ụmụnwaanyị mata ihe ndị a ka ha ghara ịta ahụhụ"", Akụkọ ndị ga-amasị gị Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" afirika-56954964,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56954964,'Mbaka adaghị iwu site n'ịgba Buhari ụgwọ' na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ a na-ekwu,Ọtụtụ ndị mmadụ amalitela itinye ọnụ n'ọsịsa Garba Shehu nyere Fada Ejike Mbaka maka ebumnuche ya ha onyeisiala Naịjirịa kwesiri iritu n'ọkwa maọbụ ndị omeiwu achụọ ya.,"Cheta na Alhaji Shehu sị na iwe Mbaka bụ maka na Buahri enyeghị ndị ọ kpọ bịa ọrụ dịka o siri chọọ. Mana ndị ụfọdụ mmadụ na soshal midia anabataghị ihe a Alhaji Garba kwuru. Ufọdụ na-ekwu na atụmatụ ikwu ndị gbanyere onye ndọrọndọrọ aka n'ukwu oge achụmta vootu ụgwọ bụ omenala ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. Otu onye n'ime ndịa bụ Maazị Gimba Kakanda sị na Shehu kwesiri ịma na ọ bụ n'ụwa ka ndị nkwado na ndọrọndọrọ ọchịchi na-erite ụgwọ ha. Bonario Nnags na-ajụ ebe Mbaka siri mejụọ n'ịsị gọọmentị Buhari nye ya ọrụ. Ọ sị na o nwere ndị kwadoro Buhari mechara nwete ọkwa dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdọ ụgbọmmiri bụ Hadiza Bala Usman. Onye ji akara @nwaegbe_nkem kwuru na a ma Mbaka dịka onye ji ego achụ ego. Onyedikachukwu Anambra na-eju ma onwere ihe dị njọ ma emee nwata ka emere ibe ya? Mana onwere ndị dị ka aka chiburu Ekiti steeti bụ Ayo Fayose na-asị ma Mbaka, ma gọọmentị Buhari, o nweghi ndi ekwesiri ịtụpụrụ ọnụ. Ka ọ kwụ ugbua, ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu ka na-arị elu dịka ụlọ ntaakụkọ Daily Trust dere na patị APC si na ha ga-ekpesara Pope maka emume Mbaka. Daily Trust sị na ọ bụ osote onye ode akwụkwọ pati ahụ bụ Yekini Nabena kwuru nke n'ụbọchị Fraịde. Ha sị na ọ sị ""Ọ bụ ajọ ihe na onye ụkọchukwu, bu onye kwesiri iji ekpere egbochi ọdachị, bụ onye na-atụ gọọmentị ọha hibere aka n'anya maka ihe ọ ga-erite dịka ọ na-aghọ aghụghọ na ọ na-ekwuru ọha."" Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa" afirika-45476910,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45476910,EFCC: Kalu abịaghị zara ọnụ ya n'ụlọikpe,A kwụsịtụrụ ikpe a na-ekpe Orji Uzor Kalu n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs maka ebubo nrụrụaka ego dị ijeri naịra atọ na ụma maka na Kalu abịaghị n'ụlọikpe n'ihi njem nleta ahụike ya.,"Kalu na onye bụbu kọmishịọna na-ahụ maka ego n'Abia Steeti bụ Ude Udeogo nakwa ụlọọrụ Kalu bụ Slok Nig. Ltd ka ndị EFCC boro ebubo izu ego gọọmenti Abia Steeti. Kalu bụ onye pati APC gọrọ na onweghi ego ọbụla o zuru dịka emechara gbapụta ya. Na mmalite ikpe nke taa, onye ọkaiwu Kalu bụ Gordy Uche rịọrọ ụlọikpe a maka Kalu na anọghị n'ụlọikpe kwuo na Kalu gara mba Jamịnị maka ịwa ahụ. O kwuru na njem ahụike ahụ nke o kwesiri ime n'ọnwa Ọgọstụ bụkwanụ nke ụlọikpe nyere ya ikike adabaghị dịka Kalu ahughị ụgbọelu ga-ebu ya e mee njem ahụ n'oge. ""Onye nwe m, lekwa akwụkwọ na-egosi mkpatị njem ahụ bụ nke bu aha na akara ekwentị onye dọkịta na-awa ya ahụ."" Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ Onye ọkaiwu EFCC bụ Rotimi Jacobs gbarụrụ ihu n'oku ịkpatịkwu ikpe ahụ kwuo na ohere enyere ime njem a gaala. ""Onye nwe m, nke a bụ ịma usoro ikpe a njakịrị nke bụ ihe akpachara anya na-eme."" Ọkaikpe Mohammed Idris n'ikpe ya kwuru na ihe mere eji nye Kalu ohere ime njem ahụike bụ maka etu o si abịa ụlọikpe kwa mgbe. O kwuru ""Agbanyeghi etu onye ọbụla ha n'obodo, onweghi onye karịrị iwu na-achị obodo, anyị ga-eso iwu na-achị obodo n'ikpe a. Onye bịara n'ụlọikpe ga-akwụwa aka ya ọtọọ."" ""Akọwaghi nke ọma ihe mere ọ bịaghị ụlọikpe nke taa, ya mere akagbuola arịrịo ya."" Ọkaikpe a buru ikpe a gaa n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Seputemba, 2018. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48031683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48031683,Nutrition: Ịhapụ iri nri ụtụtụ o nwereike igbu gị n'oge erughị eru?,"Nri ụtụtụ bụ nri a kpọrọ mkpa kachasị mkpa kwa ụbọchị; akara na akamu, akamụ na ọkpa, mai-mai na akamụ, ji mmanụ, ji na akwa.","Na nchọpụta e wepụtara n'ụbọchị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Eprelụ si n'aka mahadum nke ndị na-amụta ihe gbasara obi n'Amerika bụ 'American College of Cardiology' na Bekee si iri nri ụtụtụ nwere ike ịzọpụta ndụ mmadụ ma gụnyekwa ọrịa obi. Ngosipụta gosipụtara na n'ime ndị tozuru ihe e ji mmadụ eme ruru 6,550 siri afọ iri anọ ruo afọ iri asaa sonyere n'ime ndị e jiri mee nchọpụta n'ihe gbasara nri site afọ 1988 rue 1994. Ndị soro mee nchọpụta kwuru ugboro ha riri nri ụtụtụ. Ndị na-ahapụ iri nri ụtụtụkachasị nwe ike ịnwụ site n'ọrịa obi Pasentị ise ndị a jụụ ajụjụ sị na ha anaghị eri nri ụtụtụ, pasentị 11 sị na ọ bụ ọ dịkata ha erịe, ebe pasent 25 sịị na ha na-erị mgbe ụfọdụ. Ndị nchọpụta ahụ nyochara ndị nwụrụ were afọ 2011 - mmadụ dị 2,318 ndị sonyere na nnyocha ahụ anwụọla were hụ na o nwere ihe jikọrọ ka mmadụ si eritebe nri ụtụtụ na ọnwụ. Akụpụ ihe ndị ọzọ nwere ike ibute nsogbu dịka ịṅụ sịga maọbụ ibu oke ibu, ndị ọkamụta na-eme chọpụtara na ndị anaghị eri nri ụtụ ji pasenti 87 nwe ike ịnwụ site nọ ọrịa obi karịa ndị na-eri. Lee ihe ntụziaka Nchọpụta na arụ aka na ịhapụ nrị ụtụ nwere ike ibute nsogbu ahụike mana ndị ọkamụta Sayensi na achọ ịmata ka nke siri eme. Ngalaba na-ahụ maka ahụike ọha na mba Briten kwuru na nchọpụta ahụ egosighị hooha na ""ịhapụ nrị ụtụtụ bụ ya bụ ihe na-ebute ọnwụ site n'ọrịa obi"". Nchọpụta ahụ eleghị anya etu ndị mmadụ si eri nri na ihe bụrụ ha nri ụtụtụ NHS kwuru na websaitị ha sị, ""Ndị anaghị erị nri ụtụtụ( e jiri mee nchọpụta ahụ) bụkarịrị ndị na-ṅụbu sịga, ndị na-aṅụ oke mmanya na ndị anaghị emegharị eme mmegharịahụ; ndị anaghị erịezigbo nri, enweghị ego."" Agwa bụ nri ọtụtụ mmadụ na-eri na Naịjirịa ka ha wee nweta Protein ""Nchọpụta ahụ nyoro naanị otu nri ụtụtụ nke nwere ike ọ gaghị egosipụta ka onye si ebi ndụ ya. Mana Dọkịta Bao, onye bụ ọkammụta na ihe gbasra ka ọrịa sị ekesasị na mahadum, 'University of Iowa' kwụsiri ike na nchọpụta ha mere. Ndị mere nchọpụta kwenyere na o gosiri ihe jikorọ erighị nri ụtụtụ na ọrịa obi Bao kwuru sị: ""Ọtụtụ nchọpụta egosila ịhapụ nri ụtụtụ ga-ebulite ohere ịnwe ọrịa shuga, ọbara mgbalielu na oke mmanụ ọjọọ."" ""Nchọpụta anyị na-arụ aka na iri nriụtụtụ bụ ụzọ dị mfe isi gbalahụ ọrịa obi."" Dịka WHO siri kwuo, ọrịa obi na ahụ mgbọnwụ bụ ihe kachasị ebute ọnwụ na mba ụwa dịka o na-egbu ọnwụ mmadụ dị nde 15.2." afirika-45955903,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45955903,"Nnamdi Kanu: ""Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a"" - Ezinaụlọ na agbatobi ya",Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel na onye agbatobi ya bụ Samuel kọwara ujọ dị n'ahụ ụmụaka obodo ha bụ Afaraukwu maka ndị agha.,"Nnamdi Kanu: ""Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a"" - Ezinaụlọ na agbatobi ya Ha kọwara na obi na-amapụ ụmụaka oge ọbụla aṅụrụ ụda ndị uweojii maọbụ ndị agha. Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdị Kanu kwuru na onweghị onyeisi ọzọ IPOB nwere na-abụghị nwanne ya nwoke. Ọ gwara BBC na ozi ahụ pụtara na soshal midia kwuru na akwatuola Nnamdi Kanu dịka onyeisi IPOB bụ asị ọcha. Kanu kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ BBC gara ịhụ etu ihe si kwụrụ na be ha. Nwanne Nnamdi Kanu kwuru na ọ ka bụ onyeisi otu IPOB Mgbe BBC Igbo gagharịrị gburugburu ụlọelu ahụ Kanu na nna ya bụ Igwe ndị Afaraukwu bi, anyị hụrụ ọnụ egbe gbasasịrị ahụ aja ụlọ ahụ bụ nke e kwuru na ndị agha gbara. Uzo e si aga be Nnamdi Kanu Kanu boro gọọmentị na ndị agha Naịjirịa ebubo na Egwu Eke nke atọ bụ ka ha bịakwa laa ndụ ndị ejighi egbe ma ọ bụ mma n'iyi dịka ha mere n'Egwu Eke nke abụọ n'afọ gara aga. Ndị ụka Nnamdi Kanu gbakọtara na-ekpere ya ekpere Emmanuel Kanu kwuru na egbe niile ndị agha gbara n'isi ebe Nnamdi na-arahụ gosiri na ha bịara igbu ya egbu. Nnamdi Kanu kwuru na ọ bụ onye Jew Ọtụtụ ndị otu Ipob gwara BBC na ihe nna ha ukwu bụ Nnamdi kwuru ka ha kwenyere na ya, wee kwuo na naanị referandum ga-egbo mkpa ndị IPOB. Ndị otu ụka Kanu bụ ndị 'Judaism' zukọkwara n'uju n'ụlọ ya na-ekpe ekpere maka nlọghachite onyeisi ha. Ha ekweghị ekwu okwu n'ihe onyonyo. Otu ntupu mgbọ N'agbanyeghị na ndị agha Naịjiria ekwuola na ha adịla njikere imalite ""Egwu Eke nke atọ"", ndị bi n'ogige ụlọ Kanu na-ebi ndụ ha dịka ha si ebi oge ọbụla. Otu nwoke ụlọ ya chere ihu n'ụlọ Kanu, kwara ariri na ndị agha Naịjiria lara ọtụtụ ndụ ụmụ IPOB n'iyi oge ha mere ""Egwu Eke nke abụọ"" n'afọ gara aga. O Kwuru na ọ chịzị obi n'aka n'ihi na ugbua Nnamdi kanu pụtara ihe ọzọ, onweghi onye ma ihe ga-eme ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45452914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45452914,Lọghachitenụ na Naịjirịa maka ihe adịla mma - Gọọmenti,Gọọmentị etiti arịọla ụmụafọ Naịjirịa niile nọ na mba ofesi ka ha lọta bịa nye aka rụzie Naịjirịa na ihe adịla mma.,"Minista nka na ụzụ bụ Ogbonnaya Onu rịọrọ arịrịọ a n'aha onyeisiala Buhari n'ime ọtụtụ ọgbakọ ya na ụmụ Naịjirịa bi na mba Amerịka mere. Ebe ọ kuziri ha maka iwu ọhụrụ onyeisiala Buhari tinyere aka na ya bụ nke metụtara nka na ụzụ. Ọ gwara ndị a na ụzọ ochie eji eme ihe enyela ohere ka ụzọ ndị ọhụrụ were ọnọdụ. Onu gara n'ihu kelee ndị Naịjirịa bi na mba ofesi maka ego ha na-akwụbata kwa afọ bụ nke ọnụ ego ya ruru ijeri dọla iri abụọ na abụọ. kwuo na ọ bụ oke ihe ntụnye nye Naịjirịa "" mana anyị chọrọ ka unu lọta ụlọ"". N'okwu ya "" Biko anyị chọrọ ka unu lọghachite n'ụlọ, ọ dị mkpa. Ọbụghị mmadụ niile ga-alọta mana ụfọdụ nwereike ịmalite ịlọghachite, ọ bụ uru ya."" ""Anyị na-agwa unu na ihe agbanwela, ọ bụ ozi anyị , ọ bụ ya mere m ji bịa."" ""N'eziokwu, onweghi etu ị ga-eji gbanwee ihe niile ma mee ya nke ọma n'otu ntabi anya. Ihe kachasị mkpa bụ na e nwere mgbanwe."" O kwuru na Naịjirịa nwere ụfọdụ ndị kachasị n'amamihe n'ụwa niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Etu e si agbanarị ndị changum" egwuregwu-44499681,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44499681,World Cup 2018: Enweghị onye meriri ibe ya ka Pọtugal na Spen gbara 3-3,Enweghị onye meriri ibe ya ka Pọtugal na Spen gbara bọọlụ tọkasịrị ndị mmadụ ahụ n'abalị a.,"Daalụ maka isonyere anyị anyị taa. Sonye anyị ọzọ echi. Nkeji iri itoolu na atọ: Ronaldo nyere ndị na-akwado ya ọbara mgbali elu oge ọ dị ka o merụrụ ahụ. Mana enweghị ihe mere ya, naanị ọtịta ngwere. Nkeji iri itoolu: Ogbu bọọlụ etinyela nkeji anọ a ga-eji agbakwu bọọlụ. End of Twitter post, 1 Nkeji iri asatọ na asaa: GOOOOLLLLUUU! Ronaldo ejirila 'free kick' gbakaa neetị. Goolu nke atọ a Ronaldo nyere ga-eme ya goolu atọ n'ime otu egwuregwu (Hat-trick) nke mbụ a ga-agba n'asọmpi a. Nke a ga-eme ya goolu atọ n'otu egwuregwu nke 51 Ronaldo na-enye kemgbe o bidoro ịji bọọlụ akpata ego nri. Nkeji iri asatọ na ise: Spen ewepụla David Silva tinye Lucas Vazquez. Nkeji iri asaa na itoolu: Pọtụgal ewepụla Goncalo Guedes tinye Andre Silva. Nkeji iri asaa na asaa: Spen ewepụla Diego Costa tinye Iago Aspas. Nkeji iri asaa na isii: Quaresma zọtara bọọlụ, gbaga ya nso neetị De Gea, mana onweghị isi. Nkeji iri asaa: Spen ewepụla Iniesta tinye Thiago Alcântara. Nkeji iri isii na itoolu: Pọtụgal ewepụla Bernardo Silva tinye Ricardo Quaresma. Nkeji iri isii na asatọ: Pọtụgal ewepụla Bruno Fernandes tinye Joao Mario. Nkeji iri isii na atọ: Rui Patricio bụ oche goolu ndị Pọtụgal ejirila aka ghọtuo bọọlụ ndị Spen chọrọ iji agbaka neetị ya. Nkeji iri isii: Guerreiro agbaala 'free kick' ndị Pọtụgal nwetere, mana o nweghị isi. Nkeji iri ise na asatọ: GOOOLLLUUU! Nacho agbakaala neetị ndị Pọtugal. Nkeji iri ise na anọ: GOOOOOLLLUUU! Diego Costa ejirila 'free kick' gbakaa neetị ndị Pọtugal. Nkeji iri ise na atọ: Moutinho agbatuola Iniesta mere ka ndị Spen nweta 'free kick'. Nkeji iri ise: Bruno Fernandes chọrọ igbari neetị De Gea, mana bọolụ ya eruteghị nso. Nkeji iri anọ na isii: Ronaldo agbapụla bọọlụ ka a na-amalite agba nke abụọ. Nkeji iri anọ na ise na ụma: Agaala ezumiike nke ga-ewe nkeji iri na ise. Nkeji iri anọ na anọ: GOOOLLLLUUUU!!! Ronaldo adọkaala neetị ndị Spen. Nke a ga-eme ya goolu abụọ ọ na-enye n'egwuregwu a. Nkeji iri abụọ na itoolu: David Silva gbara 'free kick' a, mana o nweghị isi. Nkeji iri abụọ na asatọ: Fernandes akwatuola Isco, mere ka Spen nweta 'free kick'. Fernandes nwetara akwụkwọ edo edo maka ya. Nkeji iri abụọ na anọ: GOOOLLLUUU! Diego Costa enyela goolu. Nkeji iri na itoolu: 'Free kick' Ronaldo gbara biri n'ahụ ndị na-egbochi bọọlụ. Nkeji anọ: GOOOLLLLUUUU! Pọtugal enyela goolu. Ronaldo agbakaala neetị ndị Spen ka De Gea dafere ebe ọzọ kama ebe bọọlụ gara. Nkeji atọ: Pọtugal enwetala penariti ka Nacho gbaturu Ronaldo. Otu Nkeji: Ndị mmadụ na-akụrụ Ronaldo aka ka ụkwụ ya metụtụ bọọlụ ugbua egwuregwu bidoro. Pọtugal na Spen ezutebuola n'Iko Mbaụwa nke afọ 2010, ebe Spen ji otu ọkpụ goolu merie ha. Ndị nọ n'oche Pọtugal: Bruno Alves, Manuel Fernandes, Andre Silva, Joao Mario, Anthony Lopes, Ruben Dias, Ricardo Pereira, Gelson Martins, Mario Rui, Ricardo Quaresma, Beto, Adrian Silva. Ndị nọ n'oche Spen: Daniel Carvajal, Saul Niguez, Rodrigo Moreno, Thiago Alcantara, Lucas Vazquez, Alvaro Odriozola, Kepa Arrizabalaga, Cesar Azpilicueta, Nacho Monreal, Iago Aspas, Marco Asensio, Jose Reina. Ndị Pọtugal bidoro bọọlụ: Rui Patricio; Cedric Soares, Pepe, Jose Fonte, Raphael Guerreiro; Bernardo Silva, Joao Moutinho, William Carvalho, Bruno Fernandes; Cristiano Ronaldo, Goncalo Guedes. Ndị Spen bidoro bọọlụ: David de Gea; Nacho, Gerard Pique, Sergio Ramos, Jordi Alba; Sergio Busquets, Koke; David Silva, Isco, Andres Iniesta; Diego Costa. Ihe a bụ egwuregwu mbụ Fernando Hierro ga-anọ n'oche dịka onye nchịkọta nke Spen. Ka ọ fọrọ mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2018 a bido, ndị Spen chụrụ onye nchịkọta ha bụ Julen Lopetegui maka na ọ chọrọ ịgafe Real Madrid." afirika-53403661,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53403661,'N-Power ji ndị rụrụ ọrụ oge mmachi coronavirus ụgwọ ọnwa anọ' - Onye ọrụ N-Power,"Dịka gọọmentị mepere websaịt ha ka ndị mmadụ tinye aha ha, ọtụtụ ndị ọrụ N-Power na-ekwu na a kwụbeghi ha ụgwọọnwa anọ e ji ha.","Otu onye ọrụ ndị N-Power na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara sị ""e ji ihe karịrị mmadụ puku iri asatọ ụgwọọnwa ọnwa anọ nke bidoro kamgbe ọnwa Maachị"". Onye ọrụ a kọwara na ọ bụ site na nzukọ ndị ọrụ N-Power na Facebook na Whatsapp ka ndị e ji ụgwọ gụrụ onwe ha were gụta ihe karịrị mmadụ puku iri na asatọ e ji ụgwọ na steeti niile nọ na Naijirịa. Ọ kọwara na ụfọdụ ndị ọrụ N-Power nọ na ngalaba N-Health, ndị rụrụ ọrụ ahụike oge a machiri ngagharị n'ihi coronavirus anatabeghị ụgwọọnwa kemgbe anọ. Onye ọrụ a kọwara na mgbe ha gwara onyeisi N-Power bụ Salisu Na'inna Dambatta maka ụgwọ eji ha, ọ gwara ha na ngalaba N-Power gbanwere usoro ha ji akwụ ụgwọ, na ọ bụ ya mere na akwụghị ha ụgwọ, ka ha nwee ndidi. Ọ kọwara na ọ bụ n'ọnwa Mee ka e kwuru na a ga-akwụ ha ụgwọ, kama otu abụghị n'ezie. Onye ọrụ a kwukwara na ọ bụ mgbe ndị otu ha na onye ntaakụkọ kwuru okwu maka ụgwọ e ji ha ka a kwụrụ ndị ọrụ N-Power a na-akwụ N10,000 ụgwọ. Kama ndị nke nwere asambodo mahadum anatabeghị ụgwọọnwa ọnwa anọ. Onye a kwukwara na mgbe ha kpeseara iwe ha n'akara Twitter ndị N-Power, ndị ụlọọrụ N-Power gwara ha ka ha zite aha ha na ihe ndị ọzọ, nke nyere ha olileanya na a ga-akwụ ha ụgwọ mana onweghi ihe ha hụrụ. Ihe ndị N-Power kwuru Mgbe BBC Igbo kpotụrụ Halima Oyelade bụ ọnụ na-ekwuchitere Minista na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Sadiya Umar Farouq, ọ kọwara na ndị otu dị iche iche na-elekọta N-Power nọ na nzukọ maka ya bụ ụgwo e ji. Ọ kọwara na ọ ga-ezi ozi mgbe ha mechara nzukọ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ikenna Nweke: Ọ bụghị ụmụ Naịjirịa niile na-eme ihe ọjọo n'ofesi" afirika-51788455,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51788455,Israel Adesanya vs Yoel Romero: Odogwu nwaafọ Naịjirịa e turula ugo,Israel Adesanya eturula ugo na asọmpi UFC n'ụtụtụ Sọnde oge o zutere Yoel Romero.,"Israel Adesanya eturula ugo Odogwu abụo a zutere n'ogige T-Mobile Arena dị na Las Vegas na mba Amerịka. Romero mara Adesanya aka ịnapụ ya mgbanukwu ""Middle Weight Tittle"" ya. Nke a bụ mbụ mmadụ na-azọsa Adesanya mgbande ukwu a o ritere n'afọ 2019. Adesanya yi uwe ndị Naịjirịa bata ogige egwuregwu ebe a ga-apịa ya bụ ọkpọ. Nwa afọ Naịjirịa a alụọla ọgụ ugboro 18 ma merichaa ha niile. N'aka nke ọzọ, Romero alụọla ọgụ ugboro 13, merie iri, e merie ya na atọ. Israel Adesanya na Kamaru Usman, ọkaibe abụọ Naijiria ji eme ọnụ Adesanya, onye e ji 'the lsat stylebender mara' bụ na Legọs ka a mụrụ ya tupu nne na nna ya agaa mba Ghana, mechaa gaa mba New Zealand. Ọ bụghị naanị ya bụ nwa afọ Naịjirịa na-akụ ọkpọ na UFC, onye nke ọzọ bụ Kamaru Usman, onye e ji 'the Nigerian nightmare' mara. Adesanya na Usman bụcha ọkaibe n'ogogo dị icheiche ha abụọ nọ n'ime ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Adesanya ga-eturu ugo na ọgụ nke taa. @DavicSamuel kwuru na ya kwunyere Adesanya. @SunkanmiShams kwukwara na ya na-ele anya ka Adesanya merie. WHO etoola Naịjirịa Onyeisi otu ahụike mba ụwa bụ Tedros Ghebreyesus etoola gọọmentị Naịjirịa maka mbọ ha na-agba iji buso ọrịa coronavirus agha. O kwuru na ọ magburu onwe ya etu ndịọrụ ahụike Naịjirịa si ekekọrịta ihe ha mụtara site n'aka onye mbụ bu ọrịa coronavirus bata n'obodo ahụ. Mana onyeisi nglaba mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na gọọmentị na-agbasị mbọ ike ịhụ na ọrịa ọjọọ a agbasaghị na Naịjirịa. A ga-enyere ndịagha aka iji gbochie isi mgbaka Ndịagha Naịjirịa Ndị isi ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ehibela ngalaba ga na-enyere ndịagha aka ileta ahụike ha anya, ọkachasị n'ihe gbasara ọrịa isi mgbaka. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ akụkọ pụtara gbasara ndịagha igbu onwe ha maọbụ iji egbe gbagbuo ndị nọ ha okirikiri. N'ụbọchị 26 nke ọnwa February, otu onye agha ji ọkwa 'Corporal' ji egbe gbagbuo ndị otu ya mmadụ anọ, mechaa gbagbuo onwe ya. Nke a mere n'obodo Malam ftori dị na Borno Steeti. N'abalị abụọ nke ọnwa Janụwarị, akụkọ kọkwara etu otu onyeagha si were mma sụkasịa nwunye ya na nwa ya nwoke na be ha n'Ede, Osun steeti. Onyeagha ahụ jikwa mma magbuo onye agbatobi ha, gbukwaa onyeagha ọzọ chọrọ ịnapụ ya mma ahụ. Akụkọ ọjọ ndị a mere ka e hibe ngalaba ga na-eleru ndị agha anya gbasara isi mgbaka. Onyeisi mgbasa ozi ndị aha bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ha ehibela 'Psychological Counselling Unit' n'obodo dị icheiche maka ya bụ ihe. Ụlọ dara na Chaịna Ndị ọrụ gbatagbata na-agbalị ịzọpụta ndị ụlọ dagidere Ihe ruru mmadụ iri asaa tọrọ n'ime ụlọ ebe e dopuru ndị a na-enyo enyo maka ọrịa coronavirus iche na mba Chaịna n'abalị Satọdee. A zọpụtara mmadụ iri anọ n'asaa n'ime ha, ebe ndịọrụ gbatagbata ka na-agbalị ịzọpụta ndị ọzọ. Ndị ọrụ mechara kwuo na ha ahụla ozu mmadụ isii n'ime ụlọ ahụ, ebe ihe ruru mmadụ iri 28 ka ha ka na-achọ achọ." afirika-50760194,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50760194,"Igbo Town Names: Ị ma etu aha ụfọdụ obodo dịka Imerienwe, Dikenafai na ndi ọzọ siri bịa?",Gịnị mere e jiri gụọ ụfọdụ obodo aha ha na-aza?,"Ndị Igbo anaghị agụ aha ka ọ bụrụ na ha gụrụ aha, kama ha na-ama ụma gụọ aha nwere nkọwa na mpụtara A bịa n'obodo ndị dị n'ala Igbo, ụfọdụ nwetara aha ha site n'aha onye bidoro obodo ahụ, ebe ndị ọzọ nwetere aha ha site n'ihe ha gabigara mgbe gboo. Mana a bịa n'aha obodo na-aza, ụfọdụ bụ ndị ị ga-aghọta aha ha ozugbo ị nụrụ ya, ebe ndị ọzọ ga-eme ka ị kọọị ọkọ n'isi ma taa aka n'eze tupu ị mara ihe ọ pụtara. Aha ụfọdụ obodo ndị ahụ: Ọ bụghị na aha obodo ndị a ga-atọ gị ọchị, kama ọ bụ na o nwereike ịra gị ahụ nghọta dịka onye Igbo, maọbụ gbaa gị gharịị dịka onye esighi obodo ahụ pụta maọbụ mara ihe nwere aha ahụ. Ọzọkwa bụ na aha obodo ndị a akọwaghị onwe ha dịka ndị ọmụmaatụ, Ụmụọpara, Ụmụoji, Enugwu, nakwa ndị ọzọ dị ka ha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Etu Enugwu siri wete aha ya" afirika-44904578,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44904578,Anyị anabataghị arịrịọ Joe Igbokwe chaa chaa - ọkaiwu Adegboruwa,"Joe Igbokwe, odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs steeti abaala mmiri ọkụ maka ozi o dere n'elu Facebook n´ụbọchị ole n'ole garaaga.","Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC na Legos Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa gbara Igbokwe akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na n'ụbọchị 16 n'ime ọnwa nkea, Igbokwe boro gọvanọ na-achị Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe ụkwu nke Abuja maka okwu gbasara 'Election Petition Appeal' na Bekee, ha zara n'Abuja. Igbokwe arịọla mgbaghara n'elu Facebook maka ozi a. O dere na obi gbariri ya agbari maka ozi nkea o dere, na kwa na ọ bụghị echiche ya ịkparị ndị nọ n'isi oche ụlọikpe makana ya akwanyere ha ugo oge niile. Mana Adegboruwa gbadosiri ụkwụ ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere. Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị n'elu ekwentị na arịrịọ Igbokwe dere ejubeghị ọnụ nke ihicha mkparị ọ kparị ndị na-arụ ọrụ okaikpe na ọkaiwu na Naịjirịa. Ebun-Olu Adegboruwa bụ okaiwu ama ama na Legos N'ọnụ okwu ya: ""Iwe anyị na ihe Joe Igbokwe dere bụ makana ozi ya emeela ka ndị mmadụ kwụsị ịnwe ntụkwasị obi siri ike n'ihe niile gbasara ndị ọkaikpe na ọkaiwu n'ala anyị. Cheta kwa na ndị a bụ ndị ta ahụhụ ọtụtụ afọ ị gụ akwụkwọ tupu a bụrụ ndị ọkaikpe maọbụ okaiwu"" Adegboruwa kwuru na echiche ya abụghị ka Igbokwo ta ahụhụ na mkpọrọ maọbụ kwụ nha, o kwuru na ọ chọ ka Igbokwu kwupute n'ụlọikpe na Nyesome Wike azụghị mkpebi na ụlọikpe dị na Naịjirịa. Mgbọ niile anyị mere inweta Joe Igbokwe n'elu ekwenti maka ị sa okwụ a Adegboruwa kwuru amụpụtaghị mkpụrụ. Ọ zaghị ekwentị ya oge BBC kpọrọ ya. Ọzabeghịkwa ozi anyị degara ya site n'ekwentị ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51485692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51485692,Amotekun: Ihe o jiri dị iche na Forest Guards ndị ọwụwa anyanwụ,"Gọvanọ ise na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijira - Enugwu, Anambara, Imo, Abia na Ebonyi - ekwenyela n'atụmatụ 'community policing' maka nchekwa ndụ na akụnuba.","Onyeisi ha bụ David Umahi kwuru nke a n'Enugwu oge ha na onyeisi ndị uweojii bụ IGP Mohammed Adamu nwere ọgbakọ nchekwa n'Enugwu. Ọgbakọ a na-abịa dịka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpebiri ihibe otu nchekwa nke ha. Mpaghara dị icheiche na Naịjirịa malịtere inwe otu nche nke aka ha n'ihi ogbugbu mmadụ, ntọrị na izu ohi nke dịka ọ na-akawanye njọ. Ndị mpaghara ọdịda anyanwụ hibere otu nche nke ha a kpọrọ Amotekun n'ọnwa Janụwarị. Mana atụmatụ community policing na Amotekun abụghị otu ihe. Ihe dị iche na ha abụọ bụ: N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, David Umahi kwuru na atụmatụ 'community policing' adịghị iche na atụmatụ ndị ọzọ ndị gọvanọ hibere maka nchekwa. Atụmatụ ndị ahụ gụnyere 'neighbourhood watch', 'vigilante operation' na 'forests guard'. E nwekwara kọmiti ndị gọvanọ ahụ hibere maka ileba anya na nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na-enwe. Umahi kwuru sị: ""Mgbe anyị hụrụ na atụmatụ ndị uweojii yitere nke anyị na-emebu kemgbe, anyị nabatara ya."" Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu toro ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ maka ịnaba atụmatụ ya. Adamu kwekwara nkwa na atụmatụ 'community policing' ga ewulite ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasi gị: Ọgba mbọ: ""Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa""" afirika-44106501,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44106501,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị Bishọp Katọlik ehiwela ngagharịiwe,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a Ndị Bishọp ụka Katọlik ehiwela ngagharịiwe,"Ndị Bishọp ụka katọlịk na Naịjirịa ehiwela ngagharị iwe n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee maka ndị ụka ha gụnyere ndị ọzụzụ atụrụ abụọ egwuru na Benue Steeti n'ọnwa gara aga Ngagharị iwe a ga-eme n'ụbọchị ahụ aga-eli ndị a nwụrụ anwụ ma kpọkuo ndị ụka Kraịst niile ga ha gbakọta aka ọnụ mee ya bụ ngagharị iwe. Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị ndu APC na-alụ ọgụ Ọgbaghara ka na-aga n'ihu na pati APC nke Imo Steeti dịka Gọvanọ Rochas Okorocha ebola ndị ndụ APC bụ National Working Committee ebubo na aka ha dị na ya. Na nzaghachi, onye odeeakwụkwọ APC bụ Bolaji Abdullahi gwara Gọvanọ Okorocha na ọ bụ enweghi ike ịhazi mmekọrịta dị n'etiti ya na ndị nke ya bu nsogbu ya, ya ebokwasila ndị ndu APC ihe o wetara onwe ya Akụkọ ndị na-amasị gị: World Health Organisation (WHO) Otu na-ahụ maka ahụike n'ụwa bụ World health Organisation ekwuola na ha na-atụ anya ibubata ọgwụ nyọcha maka ọgwụgwụ ọrịa ebola na mba Congo na mbido izuụka a. Ha kwuru na ruru ọnụ ọgwụ puku anọ bụ ihe a ga-eziga n'ebe ahụ. N'egwurewgu Barcelona amala afọ n'ala na ebumnobi ha ịbụ ndị anaghị emeri emeri n'asọmpị La liga nke afọ a. Ebe Neymar turula ugo dịka ọkacha agba bọọlụ na France Lig Une Rangers na Akwa United enwetaghị goolu ọbụla dịka ha zutere onwe ha n'asọmpi NPFL nke izuụka Iri abụọ na otu. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ipob asaala Okorocha" afirika-48689384,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689384,Ụmụụwa atụkwasara ọgwụ mgbochi obi?,Ndị ọkammụta ahụike na-ekwụ na ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere n'Ndị ọrụ ọgwụ mgbochi na-anazị azụ.,"Na nchọcha ndị ọrụ Wellcome Trust mere, ha ji ikpo mmadụ dị 140,000 sị mba dị 140 were mee ya. Nke a mere ka ndị WHO huta ileli ọgwụ mgbọchị dịka ihe iri so na-echere ahụike mbaụwa aka mgba. Ị ga-eji ezigbo igwe ịntaneti (nke nwere Java) ji lee atụmatụ a Ndị mmadụ n'obodo unu ha nwere nkwenye n'ọgwụ mgbochi Chọọ mba Chọọ mba Ndị mmadụ na-ajụ ma ha nwere nkwenye n'okwu a. Họrọ otu okwu ka ị hụ mpụtara Akara niile nwereike agaghị eru pasenti 100 maka ọgụgụ Ndịmere nchọpụta jụkwara ndị mmadụ maka ihe ha chere maka ọmụmụ sayensi. Wellcome tulerịkọtara ọsịsa ndị mmadụ n'ọsịsa ajụjụ ise dị mkpa ma gbakọọ ""nkwenye na ndị ọkammụta sayensi"" akara nke kachasị, ọkara maọbụ nkwenye pekarịrị Ebe o si: Wellcome Global Monitor, Gallup World Poll 2018 Biko, adịghị data nọ n'ebe a Ịntaneti adịghị. Biko nwaa ọzọ. Wellcome Global Monitor ji ikpo mmadụ nọchitere anya mba 142 mee nchọcha gbasara: ntụkwasa obi na sayensi; ndị sayensi na okwu ahụike, ịmata ka ndị mmadụ sị ghọtatụ maọbụ nwee mmasị na sayensi na ahụike; ya na ka esi ahụ ọgwụ mgbochi. Nyocha a gosiri na ọtụtụ mmadụ enweghị ntụkwasi obi na ọgwụ mgbochi. Lee ihe ha zara ka ajụrụ ha ka ọ dị mma ịgba ọgwụ mgbochi: Mgbe ajụrụ ha ka ọgwụ mgbochi adị ire: Kedụ ihe o ji dị mkpa? Enwere ihe nchọcha na-enweghị mgbagha na ogwụ mgbochi bụ ụzọ ka dị ire n'igbochi ọrịa were ike igbunyu mmadụ anya dịka arụrụbara. Arụrụbara na egbunyụ mmadụ anya Ọgwụ mgbochi azọọla ijerị mmadụ ndụ n'ụwa. O melala otu ọrịa - kitikpa - ma na-ewetakwa anyị nsọ n'imela ọrịa polio. Mana ọrịa ndị ọzọ dịka arụrụbara sịrị ọnwụ na-alọhachite nke ndị ọkammụta sị na ọ bụ maka na ndị mmadụ enweghị ntụkwasa obi n'ebe ọgwụ mgbochi nọ, egwu na akụkọ abụghị eziokwu kpara ya. Dọkịnta Ann Lindstrand bụ ọkammụta n'ọgwụ mgbochi nke WHO sị na ya bụ okwu taraakpụ ka ọ dị ugbua. ""Agbaghị ọgwụ mgbochi na-adọhachi ịnweta ahụike zuruoke azụ na mbaụwa"" . ""Any resurgence we see in these diseases are an unacceptable step backwards."" ""A gaghị anabata ndọchi azụ ọbụla n'ụzọ ọbụla."" Ọrịa arụrụbara alọghachitela Mba ndị bịara nso n'ikpochapụ arụrụbara ebidola ịhụ ya bụ ọrịa ọzọ. Ngụkọ gosiri na ọrịa ahụ ebirila ọkụ n'ihe ruru mpaghara ụwa niile ebe o ji pasentị iri atọ rịa n'afọ 2017 karịa 2016. Ọjụjụ ịnata ọgwụ mngbochi maka ihe ọbụla na-etinye onye ahụ na ndị ọzọ na nsogbu ịbute ọrịa. Ọtụtụ mmadụ nata ọgwụ mgbochi a, ọ ga-akwụsị ọrịa ahụ ife ndị ahụ - ihe Bekee kpọrọ ""herd immunity"". Imran Khan nke Wellcome Trust kwuru: ""Ọ dị anyị mkpa ugbua maka ọrịa arụrụrbara, mkpuchi ọbụla pekarịrị pesentị 95 ga-ebute ọrịa ahụ ife efe."" Kedụ ebe ntụkwasị obi kachasị pee mpe? Akụkọ ọma Ọtụtụ ndị bi n'ebe ndị dị nta n'obodo kwenyere na enweghị egwu di na ọgwụmgbochi. Ọnụọgụgụ ndị dị otua karịrị na ndịda Esia ebe mmadụ dị pasentị 95 kwenyere, nakwa n'Ọwụwaanyanwụ Afrika, ebe ọnụọgụgụ ha dị pasenti 92. Mba Bangladesh na Ruwanda fọdụrụ obere ka mmadụ nile kwere na ọgwụmgbochi enweghi egwu ọbula di na ya ma na-arụkwa ọrụ, ọnụọgụgụ ndị gbarala ọgwụmgbochi n'obodo ndị ahụ buru ibu na-agbanyeghi nhịahụ a na-enwe ime ka ha ruo ndi mmadụ aka. Ruwanda bụ mba nke izizi na-etolite etolite mere ka ọgwụmgbochi HPV nke e ji egbochi ọria cervical cancer ruo umunwanyi obodo ahụ nile aka. Mazi Khan kwuru: ""Nke a na-egosi ihe anyi nwere ike imenwu ma anyi gbalisie ike ikwalite ọgbụgba ọgwụ mgbochi"". Gịnị mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ? Na nchọpụta ahụ, ndị nwere ntụkwasa obi n'ebe ndi dibia bekee, ndị nọọsu nakwa ndị sayentists nọ, na-aka ekwenye na onweghị egwu ọbụla dị na ọgwụmgbochi. N'aka nke ọzọ, ndị na-ekwenyechaghị na ọgwụ bekee nakwa sayensị, anaghị ekwenye n'ọgwụmgbochị. Akwụkwọ nchọpụta ahụ a kpọrọ 'Wellcome' agazighi nyochaba ihe kpatara ụfọdụ ekwenyeghi, ma ndị nyocha kwuru na ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata nkea. Ụfọdụ ịhe ndịa gụnyere obi iju oyi - ọbụrụ na orịa adịkwaghị ebe niile otu ọ dịbụ na mbụ, ọgaghịkwa echu ndị mmadụ ụra ịgba ọgwụmgbochi ọrịa ahụ. Ọgwụ niile, tinyere ọgwụmgbochi, nwekwara nsogbu ndị ọzọ ha na-enye. Mana a na-akpachapụrụ ọgwụmgbochi anya iji hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma ghara imebi ahụike ndị mmadụ. Igwe ịntanet emeela ka ikesa ozi gbasara ọgwụmgbochi dịwanye mfe, mana ọtụtụ akụkọ ndị ahụ anaghị abụcha eziokwu. Na mba Japan, ndị ọkachamara kwuru na akụkọ e kesara nke na-ekwu na ọgwụmgbochi HPV na-ebute ọria ụbụrụisi, mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jụ ịgba ọgwụ ahụ. Otu ahụ kwa, na mba Frans, a kọkwara asịrị banyere ọgwụmgbochi ọria influwenza - ndị mmadụ sịrị na arụsighi ọgwụmgbochi ndị ahụ ike tupu gọọmentị agaa zụrụ ha n'ọkụ ọkụ nke mere na ha anakwaghị arụ ọrụ. Na mba UK, akụkọ fesakwara na ọgwụmgbochi MMR na- ebute ọrịa ọtizim. Dr Lindstrand kwuru: ""Otu ihe dị mkpa iji mee ka obi sie ndị mmadụ ike n'ihe gbasara ọgwụmgbochi bụ i nwe ndị ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma, ndị dị nkwadebe ịdụ ndị mmadụ ọdụ nke bụ eziokwu, ma nwekwaa ike ịza ajụjụ niile ndị nne na nna nakwa na obodo na-ajụ."" Onye rụpụtara ya Becky Dale na Christine Jeavans; Onye nhazi - Debie Loizou; Onye wulitere ya - Scott Jarvis na Katia Artsenkova" afirika-50198709,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50198709,Infant Mortality Rate: Gịnị na-akpata ya nakwa etu ị ga-esi gbochie ya,Ọnwụ umụaka na-arị ibe ya elu na Naịjirịa emeela ka gọọmenti Naịjirịa wepụta atụụmatụ ha ga-eji belata ya bụ ọdachị.,"Nwa a mụrụ ọhụrụ. Ejike Ezeh bụ onyeisi ngalaba akpọrọ 'National Population Commission' onye gwara ndị ntaakụkọ maka mbọ ọhụrụ a kwuru na ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ nọ n'ogo otu narị n'ụma n'ime nwa ọmụmụ otu puku ọbụla. Nke ka agba anya mmiri bụ na ngalaba dịka UNICEF, World Health Organization, World Bank na ndị ọzọ na-ahụ maka ahụike ụmụaka na ụmụnwaanyị achọpụtala na site n'afọ 2017 ruo 2030, ihe ruru ụmụaka nde iri na isii (16 million) amụrụ ọhụrụ ga-anwụ tupu ha eruo afọ ise. Mana kedụ ihe na-akpata ya bụ ọdachị? Dọkịta Akinde Akinshola na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị kwuru na ihe isii a nwere ike ịkpata ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ: Ọ gakwara n'ihu kọwaa ụzọ e nwereike igbochi ya bụ ọnwụ Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke" afirika-50217738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50217738,"Ipob and Police clash: Ọ bụghị eziokwu, ọ bụ ndị uweojii wakporo anyị - Ndị",'Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti sị na ndị Ipob bara ha ọgụ mgbe ha gara igbochi nzukọ ha na-eme.,"Ọ gwara BBC Igbo na ha nụrụ kepukepu maka nzukọ ndị Ipob na-eme n'otu obodo n'Ebonyi na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ wụchiri ebe ahụ ịga chụsasịa ha. Ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uweojii na otu Ipob n'Ebonyi ebe ndị otu a na-agba mbọ maka nnwereonwe ha, nwere ọgbakọ. Dịka ha rutere ebe ahụ, na ndị Ipob malitere mawa ha okwute ma merụọ ụfọdụ ndị uweojii gụnyere otu onyeisi ndị uweojii n'ọgbọ ahụ bụ John John nọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ọ sị na nke a mere ha ji were anwụrụ anyammiri gbawa ndị Ipob ma nwụchie mmadụ isii n'ime ha. IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti Odah sị na otu n'ime ndị a nwụchiri ji egbe, ebe onye ọzọ bụ ọkaiwu ha n'Ebonyi bụ Ndubuisi Steven na mmadụ anọ ndị ọzọ. Ọ sị na ha kpụpụrụ mmadụ isii a n'ụlọikpe ma ọkaikpe sị ka akpọchie ha n'ụlọmkpọrọ ruo ọnwa Disemba a ga-ekpe ikpe ha ọzọ. Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma o nwere ndị Ipob ndị uweojii merụrụ ahụ, Odah sị mba na ihe ndị uweojii mere bụ iji anwụrụ anyammiri chụsaa ha. Ọ sị na Ipob bụ otu gọọmentị Naịjirịa machiri amachi na ha enweghi ikike ọbụla inwe nzukọ. Mana Ipob na-arụ ndị uweojii aka na ha wakporo ha ebe ha nọ eme nzukọ, gbaa ọtụtụ ndị otu ha egbe ma merụọ ụfọdụ n'ụzọ dị iche iche ""Anaghị amachi mmekọrịta mmadụ na ibe ya."" Na mkparịtaụka BBC Igbo na otu ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Paul Achalla nwere, ọ gwara BBC Igbo na ndị uweojii wakporo ndị otu ha gbawa ha egbe. Paul Achalla ""Ọtụtụ merụrụ ahụ, ebe e gburu ụfọdụ ma nwụchikwa ụfọdụ. ""Anyị amabeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole e ji eji maọbụ ndị e gburu."" Achalla katọrọ mmekpa ahụ nke ndị uweojii na-emekpa ndị ndị otu Ipob dịka o kwuru na onye ọbụla nwere ikike n'iwu ịgbakọrọ onwe ha. ""Anaghị amachi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Kedụ ihe gosiri na ndị gbakọrọ bụ ndị Ipob?"" Achalla onye boro ebubo na gọọmentị ji aka nro na-eso ndị Boko Haram na ndị ọchịehi ji ngwaọgụ na-ememila ndị mmadụ, gara n'ihu jụọ,""Ọ na-abụ a hụ ebe ọbụla ụmụ Igbo gbakọbara agbakanyere ha egbe?"" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52801222,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52801222,"Children's Day: ""Ịgba egwu na-enye m ọṅụ""",Ị ma agba egwu ọfụma ma ya fọdụ ikuzinwuru mmadụ etu e si agba?,Ifeoma Ofiah bụ nwatakịrị dị afọ itoolu mụtara ịgba egwu na nwata ma na-akuziri ụmụaka ibe ya etu e si agba egwu. Ofiah gwara BBC Igbo na ịgba egwu na-enye ya ọṅụ. O kwukwara na ọ chọrọ ịbụ nọọsụ mgbe o toro. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru ma mara ma e nwere otu nzọ egwu maọbụ abụọ ị ga-amụta n'aka ya. Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru Peter na Ikechukwu Kalu afirika-54990483,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54990483,Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-amachi CNN maka akụkọ nyocha Endsars ha gosiri,Minista mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed ekwuola ka amachipu ụlọọrụ ntaakụkọ CNN maka ya bụ ihe onyonyo akụkọ nyocha ha gosiri ụnyaahụ bụ Wenezde maka ngaghrịiwe Endsars ndị ntorobịa mere n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Oktoba 2020.,"Iwe Mohammed bụ onye kwuru nke a ụbọchị Tọzde bụ na CNN kwuru na ya bụ ihe ngosi, na ndị agha Naịjirịa ji mgbọ igwe gbaa ndị gara ya bụ ngagharịiwe ma gbagbu ọbụladị otu onye, bụ nke ndị agha Naịjriịa kwuru na ọ bụ ụgha. N'akụkọ CNN biputara na mgbede a, ha sị na ya bụ ihe nkiri gosiri ihe mere na ya bụ ngagharịiwe udo akpọrọ Endsars ndị mmadụ mere n'ụbọchị ahụ. Mohammed kwuru na "" Ihe a CNN mere abụghị obere ihe, e kwesiri ịmachi ha"". Ọnụ na-ekwuru CNN sị na ""ụlọọrụ ntaakụkọ ha anaghị alaazụ maka ya bụ akụkọ ha buru"". ""Anyị kpachapụrụ anya, mee ezigbo nchọpụta maka ya bụ akụkọ anyị mere, ị laa azụ adịghị na ya"", ya bụ nwaamadị dere n'akwụkwọ ozi. Ha gosiri otu nwaamadị aha ya bụ Victor Sunday bụ onye ndị be ha sị na ha ka na achọ achọ ruo ugbua. Ha sị na ha ji akụrụngwa di iche iche na-egosi ebe e sere foto na mgbe e sere ya arụ ọrụ. CNN gbara ọtụtụ mmadụ ajụjụ ọnụ bụ ndị so na ya bụ ngagharịiwe. Ha kwuru na tupu ha ewepụta ya bụ ihe onyonyo, na CNN gbara mbọ ikwuru ndị agha Naịjirịa, mana ha atụpụghị ọnụ. Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị uweojii bụ ndị so na ya bụ ebubo, mana onye ahụ atụpụghị ọnụ. CNN sị na onye ọrụ Legọs steeti ha kpọrọ sị na ha agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu nọ n'aka kọmitii na-enyocha ya. 'CNN enweghi onye ntaakụkọ na Lekki, ọ bụ ihe ha hụru na soshal midia ka ha dere' - Lai Mohammed Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed agwaala ndị ntaakụkọ na ihe ụlọ ntaakukọ CNN kwuru maka mkpa mkpa kpara na ebe a na-anata ụtụ isi ụgbọala na Lekki di na Legọs adabaghi ma ncha. Alhaji Mohammed sị na akuko CNN banyere ihe a mere na-edughe ndị mmadụ. CNN mere ihe onyonyo na akụkọ gosiri etu e si gbaa ndi mmadu egbe na Lekki, mana ndị agha Naịjirịa gọrọ na ha agbaghị ndị mmadụ egbe ọbụla. CNN sị na ha hụrụ ihe onyono gbara akaebe nakwa akaebe ndị hụrụ ihe emere bụ ihe ha jiri kpebie na o mere etu ahụ ha siri kwuo. Ihe Lai Mohammed kwuru Alhaji Mohammed sị na CNN enweghi onye ntaakụkọ na Lekki, nke mere ihe niile ha kwuur bụ ihe ha hụrụ n'ihe onyonyo ọ sị na-efegharị na soshal midia. Ọ jụrụ, ""Kedụ ebe ha gbadoro ụkwụ mee akụkọ a?"" Ọ sịkwa na CNN edeghị akụkọ ha n'ụzọ oji kwụrụ ọtọ. Ọ sị: ""Kedụ ihe mere ha ejighị tinye ọnụ okwu Ọchịagha Taiwo bụ onye nọchitere ndị agha na ngalaba na-enyocha ihe mere na na Lekki. Ọ sịkwa na CNN sibu na mmadụ 38 nwụrụ, ma kwuzịa na ọ bụotu mmadụ nwụrụ ugbua. Lai Mohammed sị na ha gwara ndi agha ihe ha ga-eme tupu ha agawa ọrụ. Ọ sị; "" Ọ bụ mgbọ agaghị egbu mmadụ ka a sị ha jiri gawa ọrụ."" Lai Mohammed sị na gọọmentị kwadoro etu ndị agha siri kpaa agwa na Lekki. Gọọmentị Legọs Steetị asaala ndị ntaakụkọ CNN maka nyocha ha mere n'ogbugbu ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS na Lekki toll gate. Gọọmentị Legọs gwara BBC Pidgin na ha enweghi ọbụla ha nwereike ikwu maka akụkọ nyocha CNN mere banyere ihe mere na Lekki. Gọọmentị enweghi okwu ọbụla ruo mgbe kọmitii e hiwere maka ilebanya na mkpagbu ndị uweojii ewepụta nyochapụta nke ha. Nke a bụ ihe ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu bụ Gboyega Akosile kwuru. Kenechukwu Okeke sị na ọ ga-akpụpụ CNN n'ụlọikpe maka nyocha ha mere n'ogbugbu ndị ngagharịiwe Otu nwoke kpọrọ onwe ya onye na-agba mbọ maka ikike dịị onye bụ Kenechukwu Okeke ekwuola na ya-akpụpụ ụlọntaakụkọ ""Cable News Network"" a kpọrọ 'CNN' n'ịchafụ ụlọikpe maka nnyocha ha mere n'ogbugbu ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS na Lekki Legọs n'abalị iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020. Ụlọọrụ ntaakụkọ ""CNN"" wepụtara akụkọ nyocha ha mere maka ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS a sị ndịagha gbagburu na Lekki toll gate. Akụkọ gosiri ihe onyonyo ebe ndịagha si, oge ha hapụrụ ogbe ha na Bonny Camp nakwa mgbe ha rutere Lekki Toll gate ma malite ịgba ndị ngagharịiwe a egbe. Akụkọ ahụ nyochakwara mgbọ tụrụ ụfọdụ ndị gbakọrọ ebe ahụ nakwa ebe o si pụta. 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ' Ọtụtụ ndị mmadụ etoola ụlọọrụ CNN n'akụkọ ebe ndị ọzọ dịka Kenechukwu Okeke katọkwara akụkọ a sị na CNN tinyere aka n'okwu ka dị n'ụlọikpe. Okeke sị n'ihi nke a na ọ ga-agba ụlọọrụ CNN akwụkwọ n'ụlọikpe maka nke a. Kedụ ihe ndịagha kwuru? Mgbe ihe a mere ọhụrụ, ndịagha Naịjirịa sị na ndị otu ha agaghị na Lekki toll gate mana ha mechara kwuo na ndị otu ha gbaliri mgbọ egbe na-enweghi ike igbu mmadụ na-elu. Dịka akụkọ nyocha CNN a pụtara, onwebeghi ihe ha kwuru banyere ya, mgbe BBC Igbo kpọrọ Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ha, ọ zaghị ekwentị ya. Mana onyeisi ndịagha bụ Tukur Buratai ekwusiela ike na ndịagha Naịjirịa na-arụ ọrụ ha ka ndị a zụrụ ọfụma. Buratai kwuru nke a mgbe ndị kọmitii ụlọomeiwu nta na-ahụ maka ndịagha kpọtụrụrụrụ n'isiụlọọrụ ndịagha na Wenesde n'Abuja. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Otu onye a kpọrọ Adamu sị na ọ gaara agba CNN akwụkwọ n'ụlọikpe kama na ọ bụ maka na ha kwenyere na ha na-eche nyocha kọmitii goomentị hiwere pụta. Remo Omokiri jụrụ na ọ kwa ndịagha ahụla nyocha ndị CNN mere? Tunde Ednut sị na ugbua ka CNN matara na gọọmentị Naịjirịa na-atụ asị." afirika-51307395,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307395,Hanan Buhari's Sim card: Ụlọọrụ onyeisiala gbochiri onye ọrụ ụlọikpe inye ha akwụkwọ ụlọikpe- Ọkaiwu,I chetara akụkọ maka Anthony Okolie bụ onye ndị uweojii nzuzo kpọchiri izụụka iri maka ịzụ ma nweghara 'sim card' bụbụ nke nwa onyeisiala Muhammadu Buhari aha ya bụ Hanan Buhari?,"E jichiri Anthony Okolie izuụka iri maka inwe 'sim card' bụbu nke Hanan Buhari, nwa onyeisiala Akụkọ pụtara taa na-ekwu na onyeọrụ ụlọikpe ukwu dị n'Abuja gara iweghara Hanan Buhari akwụkwọ ikpọ oku mana ndị ọrụ onyeisiala enyeghị ya ohere. Anthony Okolie,bụ nwa amadi ahụ a tụnyere na mkpọrọ ndị DSS abalị gbara Hanan, DSS na ụlọọrụ MTN akwụkwọ n'ụlọikpe ma na-ekwu ka ha kwụọ ya nde narị naira ise maka ijichi ya. E jichiri Anthony Okolie izuụka iri maka inwe 'sim card' bụbu nke Hanan Buhari, nwa onyeisiala Ọkaiwu Okolie bụ Tope Akinyode gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwenti na ha gbara akwụkwọ n'ụlọikpe n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2020 ka ndị ometụtara kwụọ ụgwọ megide e begidere onye ọ na-ekwuru. ""Mana oge onye ụlọikpe gara inye ha akwụkwọ, ha jụrụ ịnabata ya."" Ha kwuru na ha amaghị onye bụ Hana Buhari. Na onye bi n'obi ụlọrụ gọọment bụ Muhammadu Buhari."" Akinyode kwuru na ka o si na dị,na ha ga-alachi n'ụlọikpe rịọ ụlọikpe ohere isi ụzọ ọzọ chụwa ihe dị ha mkpa. Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bashir Ahmad amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ozi e zigara ya na soshal midia oge akụkọ na-apụta.. Asị asị ooo!!! O nweghi mgbe anyị jiri jụ inye Oyedepo visa Amerịka Ụlọọrụ ndị na-enye akwụkwọ ikikere ịbata obodo n'Amerịka ekwuola n'igwe Twitter na o nweghi mgbe ha hapụrụ inye Bishop Oyedepo ikikere ịbata obodo. O nweghi mgbe anyị jiri hapụ inye onyeisi ụka Winner's Chapel visa. Ndị Ọkada na mere ngagharị iwe na Legọs taa Ndị ọkada emela ngagharị iwe maka mmachi gọọmenti Legọs sị na ha ga-ebido echi machiwe ha ịgba n'okporoụzọ Legọs. Ha gwara ndị ntaakụkọ dị n'ebe a na-eme ngagharị iwe ha mmachi a ga-eme ka ụfọ ndị a bazie omekome. Coronavirus eruola UK Akụkọ na-akọwa na mmadụ abụọ ebutela ọrịa Coronavirus. Ndị ọrụ ahụike kwuru na mmadụ abụọ ahụ si n'otu ezinaụlọ mana ha ekwuputebeghị aha ha. ""Oteela aka anyị na-akwado maka ọrịa nke pụtara na anyị dị njikere ịlụso ya ọgụ"" ka Chris Witty kwuru. Nke a ga-eme ya mba iri na itoolu ebe ọrịa ahụ ferela kemgbe ọ malitere na mba Chaịna. Otu PDP emela ngagharịiwe n'Abuja Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'otu PDP gụnbyere Sịnetọ Enyinnaya Abaraibe na-eme ngagharị iwe n'Abuja maka ọnọdụ ala Naịjirịa Ha kwuru na ebe ndị ha ga-emetu gụnyere isiụlọọrụ mba Briten, nke mba Amerịka nakwa kọmishọn Yurop. Ndị na-efe ala nna ha eriwela N33,000 ugbua Ọ dị ka emegharịrị ekeresimesi ọzọ Ndị na-efe ala nna ha na-amali elu na-enwe aṅụrị na soshal midia dịka amalitere ịkwụ ha naịra puku iri atọ na-atọ ka ụgwọ ọnwa. Onye dịka Joshua gosiri etu o si aṅụrị nke ya Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka gọọmentị etiti kwere ha nkwa ịbulite ụgwọ ọnwa ha. Ọ nụrụ kara ibe ya - WHO Ngalaba WHO na-elekọta ahụike na mba ụwa niile etiela mkpu maka Coronavirus na-agwa ma oke ma nta ha kee nkwụcha n'ebe ọrịa a nọ. Mkpebi a bịara dịka ha mechara nzụkọ imeụlọ n'ụbọchị tọzde iji mata ụdịrị mkpamkpa ọrịa a na-akpa. Ọzọ, Ndị uweojii na Taraba steeti anwụchiela otu nwoke gburu enyi ya nwaanyị na steeti ahụ. Munda Bala kọwara na ya na enyi ya abụọ jikọrọ aka gbuo enyi ya nwaanyị n'ihi anya ụfụ na oke ihe isike dị n'obodo. N'egwuregwu, Ọgbaa bọọlụ Naịjirịa bụ Bright Enobhakare adịla nkwadobe ịhapụ otu ya bụ Wolverhampton Wanderers sonye ndị Birmingham City. Mana ka ọ dị ugbua, ekwubeghi ego ole a ga-eji zụrụ ya. Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-52661357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52661357,Biafra: 'Ndị IPOB anyị jidere egbuola ụfọdụ ndị uweojii' - Delta Police,Ndị uweojii nke Delta steeti akpụpụtala mmadụ iri ha boro ebubo ịbụ ndị otu amachiri amachi bụ IPOB nakwa ịnapụ ndị uweojii egbe ha .,"Akụkọ na-akọwa na ndị a nwere ebe atọ ha na-ezo n'ime ọhịa nke dị n'Ibusa,Okpanam na Illah dị na Delta steeti. Ndị uweojii kwuru na ha napụrụ ndị a egbe AK-47 iri na atọ ha sị ha napụrụ ndị uweojii n'ike. Dịka ndị uweojii sị kọwaa na ndị a bidoro mkpamkpa a kamgbe afọ 2018 ma sị kwa na ha chọpụtara egbe iri na atọ bụ nke ndị uweojii ha siri na ndị a zuru. Onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Onome Onvowakpoyeya gwara BBCIgbo etu ha si ndị a sị ezu ohi. Ọ kọwara na mmadụ anọ n'ime ndị ha jidere bụ mgbe ha nọ na Keke ka otu onye uweojii bidoro nyowe ha. Ndị uweojii kwụsịrị Keke ha, ma mgbe enyochara ha ka a chọpụtara mma anọ. Onvowakpoyeya kwuru na ihe ndị a bu n'obi bụ iwakpo ndị uweojii n'abalị ma zuru egbe ha. O kwu kwara na ha egbuola ụfọdụ ndị uweojii mgbe ha na-ezupụ ha egbe ha. Onvowakpoyeya kwukwara na ndị a ha jidere bụ ndị ji ọnụ ha kwuputa na ha bụ ndị otu IPOB. BBCIgbo gbara mbọ ịnweta Emma Powerful bụ ọnye bụ onyeisi odeakwụkwọ otu IPOB maka mmekọ ọha, kama ekwenti ya agaghị. Kama ọ depụtara akwụkwọ were si na ndị a ndị uweojii nwụchiri abụghị ndị otu IPOB. Powerful kwuru na ndị otu IPOB ejighi ọgbaaghara achọ ihe ha na-achọ kama na ha bụ ndị na-achọ udo. Onye bụ okaiwu ndị otu IPOB bụ Aloy Ejimakor kwukwara na ndị a ndị uweojii nwụchiri abụghị ndị otu IPOB ma sịkwa na IPOB abụghị ndị ọgbaaghara. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43112044,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43112044,Cave: Ọgba nwaanyị nọ na nsọ anaghị aba,Ọgba na Ọgbaagada dị n' Obunọfia n'Okpuru Ọchịchị Ezeagụ n' Enugwu Steeti bụ nke nwere nsọ dị iche iche nakwa ihe nribama e jiri mara ya.,"Ikwaiko na nwaanyị nọ na nsọ ya anaghị aba Ọgba Ezeagu Ndị obodo ahụ gwara anyị na iwu nakwa nsọ di n'Ogba gunyere na nwaanyi nọ na nsọ ya agaghị abanye na ya bụ ọgba. Ọ ga-akachie nti banye, ọ ga-ahụ nnukwu agwọ ga-achụpụta ya. Ihe ọzọkwa bụ na nwaanyị anaghị eyi uweimeahụ abanye ọgba ahụ, uwe agada bụkwazị ihe nsọ na ya. N'ọgba ahụ, naanị otu ụdị anụ ka onye chọro ka o ga-egbu wee laa n'ulọ. Ya bụ na amaghị ebe Ọgba ahụ obidoro nke a na ama ebe o jedebere mọọbụ ebe mmiri si na ya agbapụta oge niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmiri si n'Ọgba ahụ gbadatara wee ghọrọ obosara mmiri nke ana-akpọ Ọgbaagada. Mmiri Ọgbaagada ahụ bụ nke ndị mmadụ si ebe dị iche iche na-abịa egwu mmiri na ya . Ndị nchekwa mmriri a n'Obunọfia, Ezeagu kwuru na onye ọbụla nwereike igwu mmiri n'ebe ahụ mana onye anwakwala anwa kwaa iko na ya bụ mmiri. Ha kwuru na ọ bụ ọru ha igwa ndị ọbula na-abịa nleta na ya bụ ebe ọkachasi ụmụakwụkwọ, ihe ndịa na-asọ nsọ. Onye ọbụla nupuru isi n'ihe Ọgba na Ọgbaagada ahụ na asọ nsọ na-enweta ntaramaahụhụ ya ozigbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57297852,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57297852,Man City vs Chelsea: Etu o si akpọtụ ebe niile maka mmeri Chelsea,Uwa nile ekwetela na Chelsea bụ Eze bọolụ n'Iropu niile dịka ha ji otu ọkpụ goolu were merie ndị otu Manchester City n'asọmpị Champions League.,"Nke a na-eme ya ugboro abụọ ndị otu Chelsea na-ebuli iko Champions League. Nke a mekwara ya ugboro atọ Thomas Tuchel na-anyụ Pep Gurdiola ịkpakụ kamgbe ọ nọchịri Frank Lampard dịka onye nkuzi otu Chelsea. Ọ bụ Kai Havertz nyere ya bụ otu goolu dịka ọ fọrọ elekere atọ ka emechie agba nke mbụ na ya bụ asọmpị. Dịka o siri dị, ọṅụ juputara ndị nkwado Chelsea niile. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nturuugo otu Chelsea @PeterPsquare - "" Kedụ ndị bụ Eze Iropu?"" @Van_Clasher kwuru sị, "" Konte mụọ amụ, ụwa niile a bụrụ sọ aṅụrị. unu abọọla chi"" @Teewalayo sị, "" Nke a bụ nkarị, obi dị mụtọ na m na-akwado Chelsea."" @ay_Dauda - ""Ọtụtụ ndi mmadụ yi uwe ndị chelsea bịa ekpere na Mosque ụtụtụ a"" @comrade_love - ""Abalị satụde gosiri na Ngolo Konte bụ dike"" @Saintcarter6 - "" Chelsea nke m"" @EastonDavis8 - "" Ka chi foo Chelsea, Daalụ nụ""" afirika-57161008,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57161008,"Igbo Language: Maka ndị sị na o nweghị ebe e ji asụsụ Igbo eje, leekwa ihe ndị mere ya asụsụ e ji eje mba","N'afọ 2006, ngalaba otu 'United Nations' na-ahụ maka omenala na sayensị bụ 'United Nations Educational, Cultural and Scientific Organization' (UNESCO) buru amụma na ""ọkara asụsụ a na-asụ n'ụwa ga-efu na ngwụcha afọ otu narị na-abịa abịa"".","Asụsụ Igbo so na asụsụ ndị Unesco kwuru ga-ada mmiri n'oge na-adịghị anya dịka ha mara amụma na ọ ga-efu n'afọ 2025. Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo? Otu 'Linguistic Society of America' kọwara 'asụsụ na-efu efu' (endangered language) dịka 'asụsụ nwere ike ikpochapụ na nsonso"". Ndị ọkachamara kwuru na ya bụ amụma nwere ike imezu n'ihi etu ndị igbo, ma okenye ma ụmụaka, si asọ ịsụ igbo maọbụ ide ya ede asọ, ebe ọtụtụ na-agwakọ ya na Bekee. Amalinze Azi bụ onye nwere ụlọọrụ na-ahụ maka nkwalite asụsụ Igbo kwuru na ""ọ bụrụ na ndị okenye agbalịsịghị ike. Ọdịda asụsụ Igbo ga-esi n'aka ndị okenye"". Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya Amalinze kwuru sị: ""Igbo enweghịkwa ndị okenye na-asụ Igbo akụghị mmiri dịka Nnamdi Azikiwe, Emeka Ojukwu na Alex Ekwueme."" Otu onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ Adaobi Tricia Nwaubani gwaburu BBC na ""nne na nna m machiri ịsụ Igbo n'ụlọ anyị oge m dị obere"". Nwaubani, onye Ụmụahịa kọwakwara na nne na nna ya na-asụkwa naanị Bekee n'ụlọ ha, na-agbanyeghị na ha ji asụsụ Igbo too. Mana ndị ọzọ na-ekwu na ọdịda asụsụ Igbo si n'aka ma ndị na-eto eto, ụfọdụ n'ime ha e jighị ya kpọrọ ihe. Lee ụfọdụ ihe nka asụsụ na ide Igbo nwere ike i mere gị: 1. Igbo ka e ji ama Igbo Ọkụkọ hapụ kwọm ọ ga-eji gịnị azụ ụmụ? Anapụ ogoli ihe o ji ama mma, mma ya arụọ. Amalize kọwara na ọ bụ asụsụ bụ isi a hụrụ kwawa okpu n'okwu agbụrụ onye bụ. ""Asụsụ mere anyị Igbo. O bụrụ na enweghị asụsụ Igbo, o nweghị ihe dịka ndị Igbo,"" Amalinze kwuru. ""Asụsụ bụ isi omenala. Ndị Igbo amaghị asụ ịgbo nọ ka ndị nọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ."" 2. Igbo bụ igodo e ji agbape ụzọ zoro ezo Ilu Igbo sịrị na anya ka okenye ji agwa nwata ma ihe okwu. Ilu na okwu ka Igbo ji akụziri nwata ụzọ. Ọ na-ata arụ na ntị iji asụsụ ọzọ akọwara nwa afọ Igbo ilu Igbo n'ihi na Igbo sị na ""onye a tụọrọ ilu kọwaara ya, mara na ego e jiri lụọ nne ya lara n'iyi"". Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị asụsụ nwere ike ịkọwali nghọta dị n'ilu na okwwu Igbo n'ụzọ o zzuru oke ma rijuo afọ. Ọzọ, onye Igbo nwere ike ịnọ n'etiti igwe mmadụ ya na nwanne ya agba nwanne ya izu nke ntị ọzọ agahị anụ maọbụ ghọta. Mkparịta ụka BBC Igbo na Ikeogu Oke Amalinze sị na ""ị ma asụ ma na-ede Igbo ga-eme ka gị na ndị be ụnụ na-akparịta, onye mba ọzọ agaghị anụ ihe ụnụ na-ekwu"". Mana ọ bụghị naanị nwafọ na nwa afọ iji ya gbaa izu bụ uru dị ya, asụsụ Igbo bụ okwu Igbo ji anabata ndị tozuru etozu n'otu nwere ogogo n'ala Igbo. Ndị Igbo makụọ nụ omenala unu - Bob Manuel Udokwu Otu ndị a gụnyere otu mmanwụ, otu ọgbọ, nze na ọzọ. Ya bụkwa ihe e ji atọpe ihe omimi dị iche e ji Igbo zochie n'otu ndị a. 3. Igbo ga-enyeli gị ọrụ nwere agba Maka ndị na-ajụ ebe e ji asụsụ Igbo eje, Ị matara n'ụfọdụ ụlọọrụ nwere agba n'ụwa dịka Google nakwa BBC nwere ọrụ bụ naanị ndị ma asụ nakwa ede Igbo nke ọma ka edobeere ya? E nwekwara ọtụtụ ndị ọkammụta Naijiria nọ ala Bekee ndị ọ bụ nka na itinye uchu na nkwalite asụsụ Igbo mere ha ihe ha bụ taa. Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere bụ onye gụrụ Igbo na mahadum kọwara, ""Mgbe m na-agụ akwụkwọ, ụfọdụ na-ajụ anyị ihe e ji Igbo eme? Ufọdụ sị na ọ bụ ka ewere nara asambodo mahadum. O nweghị onye chere na BBC ga-emebe BBC Igbo"" ""Ugbua ụwa niile na-achọ Igbo. Mgbe a na-ewe n'ọrụ na BBC, Igbo, a jụrụ m ma ama maka asụsụ Igbo. """ afirika-43337251,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43337251,Aisha Buhari: Ndị Boko Haram hapụrụnụ anyị ụmụ anyị,Nwunye onyeisiala Naịjịrịa bụ Aisha Buhari etiela mkpu ka ndị Boko Haram na ndị omekome ndị ọzọ na-eyi ọha egwu kwụsị ịtọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Nke a bụ iji tinye olu ya n'okwu mba ụwa dịka e mere mmemme ncheta ụmụnwaanyị ụnyaahị. N'okwu ya, Aisha kwuru na Maachị 8 dị iche na mmemme ndị ọzọ maka ụmụaka Dapchi na Chibok ndị kwesiri ị nọ na be ha. Ọ malitere okwu nke ọ kpọrọ ""Hapụru anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị"" nke o kwuru na ọ bụ oku ọ na-akpọ iji kwụsị ntọrị, ebe ọ rịọrọ ndị mgbasaozi ka ha gbasara ya ozi a. Ọ gwakwara ndị nwunye gọvano ka ha sonyekwa na mgbasaozi ahụ na steeti ha dị icheiche ka ọ na-akpọtu n'akụkụ Naịjirịa niile. Ọ sịrị: ""Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị"" ka o kwuru. O depụtakwara ya n'ozi ya n'igwe Facebook. Na mbido, nwunye osote onyeisiala Naịjiria bụ Dolapo Osibanjo kelere ụmụnwaanyị na mmemme nke ụbọchị ụmụnwaanyị mana o kwuru na ụmụnwaanyị Naịjirịa nọ n'ọnọdụ dị njọ n'oge a. Ihe ndị ọzọ ụmụ Naịjirịa na-ekwu gbasara ụmụnwaanyị Ụmụ Naịjirịa na Twitter na-ekwupụta uche ha gbasara mmemme ncheta ụmụnwaanyị : Ola Ola kwuru na ụmụnwaanyị na-akwado onwe ha na-akwụkwa onwe ha n'azụ. Saamira Sanusi kwuru na ya na-ebu n'uche na o nwere nwata nwaanyị na-ele ya anya oge ọbụla ya na-eme ihe ọbụla. Stella Udobong kwuru mkpa ọ dị ka a zụgharịa ụmụaka ma kuziere ha mkpa ndụ dị ka a ghara iji ụmụnwaanyị mere ndị na-ebu ogbunigwe dịka ndị Boko Haram na-eme. Ụfọdụ chetakwara dọkịta Stella Ameyo Adadevoh bụ onye tufuru ndụ ya iji zọọ ndị ọzọ ndụ oge ọrịa Ebola wakporo Naịjirịa n'afọ 2014 nakwa onye bụbụrụ Mịnịsta ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nke nwụrụ anwụ bụ Dọra Akunyili. N'aka nke ọzọ, onye odeakwụkwọ mba ụwa a ma ama bụ CHimamada Ngozi Adichie akpọọla oku ka mmadụ niile tinye uchu na ịkwado ụmụnwaanyị. Chimamanda kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka, lee ya n'onyonyo a: Chimamanda akọwapụtala onye ""feministị"" bụ Chimamanda tinyere olu ya n'egwu oti egwu mba ụwa bụ Beyonce. Akụkọ ọzọ ga-amasị:" afirika-48803909,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48803909,Drug Abuse: A tụgharịrị okwu banyere ndị uweojii ise igbo - Adinuba,Don Adinuba bụ Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambara steeti awụọla miri oyi n'akụkọ ụfọdụ ndị ntaakụkọ dere banyere ndị uweojii na Gọvanọ Obiano.,"Willie Obiano nọ agba nke abụọ ya dịka gọvanọ Anambara steeti Ụnyaahụ ndị ntaakụkọ dere na gọvanọ Obiano sị ka ndị uweojii kwụsị ịnụ ọgwụ ike ọkachasị nke akpọrọ igbo maọbụ indian hemp. Akụkọ sịbụ na ọ bụ Dọkịnta Simeon Onyemaechi - bụonye nọchịtere anya Ọbịanọ n'ọgbakọ nkuzi nke ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ịkpachi ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) hiwere n'Ọka, isiobodo Anambra steeti - kwuru ihe okwu. Akụkọ sị na Dọkịnta Onyemaechi sị na ""ọ ka mma ịgbasọ ọrụ nchekwa site atụmatụ nke ọgbara ọhụrụ, karịa ịji akpụobi sitere n'anya igbo arụ ọrụ ha."" Dọkinta Onyemaechi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchedo ahụike nke Bekee kpọrọ Health Insurance Scheme. Maazị Adinuba sị na ọ bụ eziokwu na Dọkịnta Onyemaechi gara nnọchite anya Obiano n'ọgbakọ a, ma kwukwa okwu banyere ọgwụ ike ""dịka ọ bụ ihe eji mee ya bụ ọgbakọ"" okwu ya abụghị ịkọ ndị uweojii ọnụ maọbụ bo ha ebubo. Ọ sị; ""Ọ bụ ka onyeisi ndị NDLEA n'Anambara bụ Sule Momoh kwuchara okwu we si ka ndị nchekwa nye aka lụsị ọgwụ ike ọgụ site n'ime ndị eji ama atụ ka Dọkịnta Onyemaechị tinyere ọnụ wee kwado okwu a. ""Nke a were buru makana ndị sị na ha na-anụ ọgwụ ike iji nye ha mụọ ịrụ ọrụ."" Maazị Adinuba gara n'ihu kọwa na onweghị oge okwu jiri bụru ohere iji katọ ndi uweojii dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed na nzaghachị kwuru na anya doro ndị uweojii n'ọrụ ha, na ha anaghị akpa agwa ekwesịghị ekwesi. Mohammed sị; ""Ndị ọrụ anyị bụ ndị na akpa agwa kwesịrị ekwesị. O nweghị ihe aka ebe gọsịị na ha na-akpa agwa dị aṅa."" Akụkọ ga-amasị gị: Don Adinuba maka ndị ọchịehi Fulani." afirika-53878084,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53878084,Umaru Altine: Ị ma nwoke Fulani a bụ 'Mayor' Enugwu?,Mallam Umaru Altine bụ Meyọ (nke Bekee kpọrọ Mayor) na mpaghara ụfọdụ n'Enugu steeti.,"Altine bụ onye mbụ meriri ntuliaka maka ọkwa Meyọ nke afọ 1952, wee chịa ruo 1958. Ọ chịrị n'ebe anyị ma ka Enugwu municipal council n'Enugwu steeti ugbua. Ọ zọrọ ọkwaọchịchị site n'otu patị NCNC ya bụ National Council of Nigeria and the Cameroons; nke Herbert Macaulay hibere n'afọ 1944. Onyeisiala mgbe ahụ bụ Nnamdi Azikiwe sokwa n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị NCNC n'oge ahụ. Ọ bụkwa otu patị a ka onye onyeisiala Naịjirịa nke mbụ bụ Nnamdi Azikiwe jiri baa ọchịchị. Gịnị ka anyị ma maka Malam Umoru Altine? Olee ihe Meyọ na-eme? Ụfọdụ ndị dere maka Altine na-ekwu na ọ lụrụ nwaanyị Igbo mana o nwebeghi ihe gosiri ya kpọmkwem. Ka ọ dị taa Ọ bụ eziokwu na ọ rara ahụ ịhụ onye si mpaghara ọzọ na Naịjirịa imeri ntuliaka na mpaghara na-abụghị nke o si pụta, mana ọ ka na-eme. Taa, onye Igbo, Emeka Idimogu, so na ndị omeiwu na Legọs steeti. Idimogu meriri ntuliaka n'afọ 2015 nakwa 2019. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-46428642,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46428642,Childbirth: E jirila akpanwa onye nwụrụ anwụ mụta nwa dị ndụ,"A na-ekwu na ""Bekee wụ agbara"", ihe a ndị ọkachamara sayensị mere ebe ha si n'akpanwa onye nwụrụ anwụ mee ka a mụta nwa dị ndụ, egosila ya.","E ji ịwa afọ mụọ nwa ahụ n'ụbọchị 15 nke Disemba, 2017 Usoro e ji were akpanwa ahụ si n'ahụ onye nwụrụ anwụ tifee ya n'ahụ onye nke dị ndụ nakwa inye ya nleta onye na-achọ ọmụmụ, ruru awa iri, n'ụlọọgwụ dị na Sao Paulo dị na mba Brazịl. Nwaanyị ahụ mechara mụọ nwa nwaanyị a, ebughị akpanwa pụta ụwa. Nke ya bụ mbụ mmadụ na-esi n'ọnọdụ ahụ amụ nwa dị ndụ, makana ugboro iri a nwaburu ya, o nweghị isi maọbụ afọime ahụ a pụọ. Mana n'aka ọzọ, e werela akpanwa onye dị ndụ nye onye ọzọ ugboro 39, nke gụnyere ndị nne nyere ụmụ ha akpanwa ha, ebe esirila mụta ụmụ iri na otu. Inye ọgwụ N'okwu a, nke Lancet dere maka ya, onye nyere akpanwa ya, bụ otu nne ụmụ atọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri ise nke ọbara ịgba n'ụbụrụisi ya gburu. Onye natara akpanwa ya nwere ọrịa a kpọrọ ""Mayer-Rokitansky-Küster-Hauser syndrome"", bụ ọrịa na-arịa otu n'ime ụmụnwaanyị 4,500 niile, ma bụrụkwa ọrịa na-eme ka akpanwa nakwa ebe nwaanyị si amụ nwa ghara ịrụ ọrụ etu o kwesịrị. Ka o sila dị, enweghị ihe mere akwanwa ya. Ndị dọkịnta nwetere ohere iji wepụta ya, dewe ya ebe ya na ọbara ọcha si n'ahụ onye ga-abụ nna nwa ahụ ga-enwe mmekọ, ma tinye ya na njụoyi. E nyere nwaanyị ahụ ọgwụ ndị mere ka ihe na-alụso ihe ọjọọ ọgụ n'ahụ ya nke Bekee kpọrọ ""Immune system"" , daa mba. Nke mere ka ahụ ya ghara ịjụ akpanwa ahụ e tinyere n'ahụ ya. N'ime mmadụ iri ndị anatara akpa nwa onye nwụrụ anwụ wee tinye n'ahụ ha, nke a bụ nke mbụ nwerela isi ""Ihe ọma merela ndị ọgwụgwọ"" Ka izu isii gachara, ọ malite ịhụ nsọ ya. Ka ọnwa asaa gachara, e tinyere akwa ndị ahụ e tinyere na njụoyi n'ime ahụ ya. Ka o buchara afọime ya gara nke ọma, ọ mụrụ nwa ya ha paụnd isii n'ibu, site n'ịwa ahụ a wara ya n'ụbọchị 15 nke Disemba 2017. Dkta Dani Ejzenberg, nke si n'ụlọọgwụ das Clínicas dị na São Paulo, kwuru sị na usoro ga-eme ka ụmụnwaanyị na-enweghị ikike ịmụ nwa nwee ike ịhụ ndị ga-enye ha akpanwa nakwa ụlọọgwụ ga-egbonwu mkpa ha." afirika-46760831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46760831,Forbes report: Ihe mere Naijiria jiri gbaa ọnyụpa n'obodo kacha mma na-azụmaahịa,Ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Forbes nọọrọ ụbọchị Wenezde kwupụta Naijiria dịka otu mba kachasị gbaa ọnyụpa n'azụmahịa.,"Ndị ojiegoachụego na-atụ arịrị na ịchụ nta ego na Naijiria na-esiwanye ike site n'inweta akara ọnụọgụgụ ya dị otu narị na iri (110) na mba ụwa, nakwa ndị nke iri na-anọ n'Afrịka. Nke a bịara dịka ọgbatachara ndị nke atọ na mba Afrịka n'afọ 2018. Mba ndị ọzọ bụ isi n'ihe ngụpụta a gụnyere United Kingdom (1), Sweden (2), Hong Kong (3), Netherlands (4), New Zealand (5) nakwa Canada (6). Mba United States nwetara akara dị (17), ebe mba South Afịrịka gbara ndị nke mbụ na mba Afịrịka gbaa gburugburu. Dịka otu Forbes siri kwuo, ihe nyere aka na ngụpụta a bụ nke ruru iri abụọ na ise gụnyere: ikikere ịnwe ngwongwo prọpati, imepụta ihe, ụtụ isi, nka n'ụzụ, mpụ, nnwere onwe, ogogo obibi ndụ, ndị ọrụ, ihe eji ebi ndụ nakwa ndị ọzọ. N'okwu ya oge BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'ekwe ntị, onyeisi na ngalaba (Banking and Finance) na Mahadum steeti nke Nasarawa, bụ Ọkammụta Uche Ụwaleke, gosipụtara enweghị afọ ojuju ya n'ebe ihe ngụpụta a dị, ma dụzie gọọmenti dị iche iche ọdụ ka ha saa anya na mmiri ma chọpụta ihe n'ebuta ọnyụpa a, ma gbochie ya. Na ntụnye ya, onye ji ego achụnta ego nọ n'Abụja, bụ Maazị Anthony Agbo, gbarụrụ ihu, ma kwuo na ọnọdụ a ga-eme ka azụmahịa dị iche iche ndị mmadụ new nwụọ, ma butekwa ihe isi nye ndị mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46740015,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46740015,Asuu strike: anyị chọrọ ka ha kwụsị abụbọọrụ maka ntụlịaka 2019 - Inec,Onye nkwuchiteọnụ Inec bụ Mike Igini ekwuola na ha akpọkuola ndị otu Asuu ka ha kwụsị abụbọọrụ nke ha bidoro n'afọ gara aga.,"O kwuru na nke a ga-enyere ha aka na n'emume ntụliaka nke ga-amalite n'onwa Febụwarị n'ihi na ọtụtụ ọrụ dị na nkwado ntụlịaka bụ ụmụakwukwọ na ndị na-efe ala nna ha na-arụ ya. Igini kwuru na ndị otu Inec akpọọla nzukọ a ga-anọ n'ụbọchị Fraịde na-abia abia, ka ha na ndị ASUU were nọdụ ala tụlee ya bụ okwu. O kwuru na ha ji n'aka na nzukọ ha ga-aga nke ọma n'ihi na ọ dị mkpa na abụbọọrụ a bere tupu ebido emume ntụlịaka. O kwuru na ọ dị mkpa maka na ọnụọgụgụ ndị debara aha ịtụ ntụlịaka n'afọ a akarịala ihe ụmụ Naijirịa na-efe ala nna ha ga-emenwu. Ya bụ na ikikere ụmụakwụkwọ mahadum dị nnukwu mkpa na ntụlịaka a. Igini kwukwara na INEC ghọtara ọnọdụ ndị ASUU kama na ọ bụ ebumnobi ha na gọọmentị etiti ga-eme ihe ha kwesịrị ịme ka abụbọọrụ a bie. Nchọpụta ndị BBC mere gosiri na ndị na-efe ala nna ha ugbua bụ ndị 'Batch A' ga-efecha ala nna ha n'ọnwa March. Abụbọọrụ a gaba n'ihu, ihe ọpụtara bụ na agaghị enwe ndị ọzọ ga-abanye were bido ebe ndị 'Batch A' kwụsịrị. Ya bụ na abụbọọrụ a ga-emetụta nkwado ndị kwesịrị ife ala nna ha, nyerekwa aka n'emume ntụlịaka. Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwuru na abụbọọrụ ha agbasaghị Inec, kama na ha ga-aga nzukọ ha were nụ ihe INEC nwere ikwu. O kwuru na ha ga-ama ebe ha kwụ ma ha nọsịa nzukọ ahụ. Akuko ndi ga-amasị gị:" afirika-47690657,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47690657,"Restructuring: ""Anyị na Awusa na Yoroba ga-esusu ọnụ"" - Joe Igbokwe","Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'alaigbo etinyela ọnụ no okwu gbarasa njem nleta ndị ọnụ na-eru n'okwu n""Alaigbo mere na bee Naia Nwodo bụ onye ndụ Ohaneze Ndi Igbo.","Ndigbo dị iche che na-etinye ọnụ na ya bụ okwu na-ekwuputa ụcheobi ha. Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru APC na Legos sị na agbanyeghị na ya bụ njem dị mma, mana na Ndịgbo anaghị achụ ya bụ ""Restructuring"" ka o sị kwesi. ""Ndị ọbụla kweisiri ị na-agbalị na-achọ otu ọ ga-esi adiri ha mma, mana ihe na-eche m ụche bụ na m amaghị ka anyị ana aga ya n'ụzọ ziri ezi."" Restructuring: ""Anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ"" - Joe Igbokwe ""Ndịgbo apụghị ịme ihe dị na ya naanị ha. Anyị kwesiri ịgakwuru ndị agbụru ọzọ dịka Awausa maọbụ Yoroba ka ya na ha rụkọọ"". Igbokwe ịs na ọ bụrụ na Igbo turu vootu nke ọma na ha kaara ịnwe onye ga-anọchite anya ha dịka onyeisi omeiwu ụkwụ bụ onye nwere ike ịnye aka mee ka ya bụ atụmatụ bịa na mmezu. Mana na nke ahụ emeghị. Restructuring: ""anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ"" - Joe Igbokwe Greg Anyaegbudike bụ onye ọrụ mmepe obodo zara Joe Igbokwe na ""ọ bụghị naanị otu ụzọ ka esi eje ahịa"". Ọ sịkwa na okwu gbasara ịhazighari Naịjirịa abụghị maka ntuliaka ka eji mee ya. Otoro njem nleta ahụ ndị nwere agba nwere ma na-ekwu na ""ntị agaghị ezu ike rue mgbe ihe dị n'ọnụ ya gwụru. N'ihi nke a, Anyaegbudike kwuru ọ dị mkpa ị na-ekwu okwu gbasara ""restructuring"" mgbe niile ruo mgbe ọ bịara na mmezu. Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe" afirika-45176267,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45176267,"Ị ma na ị nwere ike iji N10,000 bido akaọrụ ndị a?",Ị ma na enwere ọtụtụ akaọrụ mmadụ nwere ike ime na-etinyeghị nnukwu ego na Naịjirịa? 1: Nri,"Ebe ọ bụ na ndụ dị, iwu bụ na a ga-eri nri. Nri bụ ihe a na-enweghị ike ịkwụsị ire n'ụwa, makana onye ọbụla kwesịrị iri nri maka ịdị ndụ. Ebe ọbụla a na-ere nri, a ga-enwerila ndị ga-azụ ya. Ọtụtụ ndị na-ere nri kwuru na ha ji ihe dịka puku naịra iri wee bido akaọrụ a. Ọ bụrụgodu kpekere maọbụ chin-chin, ebe ọ bụ ihe na-abanye n'ọnụ, ị ga-ahụ ndị ga-azụta ya. 2: Mmanya Mmanya ụtọ, mmanya nkwụ na ngwọ, nakwa nke e si na mkpụrụ osisi emepụta nke Bekee kpọrọ 'Smoothie' bụ ihe mmadụ nwere ike na-etinyeghị ego buru ibu. Etu i si mezie ya ga-eme ka ndị mmadụ zụọ maọbụ ghara ịzụ ya. 3: Mkpụrụ osisi Mkpụrụ osisi anaghị agwụ agwụ makana otu laa (kwụsị ịmị), mgbe ahụ ka ọzọ ga-apụta. Makana e nwere mkpụrụ osisi nke na-apụta n'oge udummiri ma nwee nke na-apụta n'ọkọchị, akaọrụ a bụ nke ga na-eweta ego. Ị na-ere ihe dịka oroma, ọ laa, ị bido rewe mangoro maọbụ ube na ndị ọzọ wdgz. 4: Ịsa akwa Ibido akaọrụ a, ihe ị ga-achọta mmiri, gote ncha, efere ị ga-eji asa akwa na eriri ị ga-eji agbasa akwa ma ị saa ya. Ihe ọzọ ị nwere ike ime bụ ịzụta igwe e ji ede akwa. Ị nwere ike na-aga n'ụlọ ndị mmadụ na-asara ha akwa, ọkachasị ndị na-arụ ọrụ Bekee na-anaghị enwe ohere. 5: Ịkpa isi Ọtụtụ ndị na-akpa isi nwere ike ịbịa n'ụlọ gị kpaa gị isi, ụdịrị ọbụla ị chọrọ. Ị nwere ike gwa ha zụta ihe ndị ha chọrọ iji kpaa isi, ebe ị ga-eji naanị mbọ isi nakwa ude isi bịa. Ị kpaa ọtụtụ ndị isi, ị nwee ike nweta ego. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45463852,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45463852,Ndịagha Naịjirịa achụsasịala ndị Boko Haram na Gudumbali,Ndị agha Naịjirịa awuchiela ma busokwa ndị Boko Haram agha n'obodo Gudumbali dị n'okpuru ọchịchị Guzamala na Borono stetti.,"Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria N'akwụkwọ ozi onye nkwuchiteọnụ ndịagha bụ Brigadier General Texas Chukwu bipụtara kọwara na ndị Boko Haram wakporo obodo ahụ n'abalị ụbọchị 7 ọnwa Sepụtemba iyi ndị mmdụ egwu. End of Twitter post, 1 O kwuru na ndị ọchị ehi ahụ kwechiri ịpụ mana ndịagha Naịjirịa emehirị ha ebere cha cha ebe ha merụrụ ha ahụ dị egwu. Onyeisi Command Sector 3 ndịagha bụ General Uwem Bassey kelere ndị agha ahụ maka ịnapụta obidi ahụ n'aka ndị Boko Haram ma gwa ndị obodo ka ha gbado anya ma na-emekw ihe dịrị ha na-atụghị ụjọ. Cheta na ndịagha Naịjirịa eteela ha na-aluso ndị oyi egwu Boko Haram agha mana a chụọla ha ọsọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53335806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53335806,"Coronavirus Update: Tuberculosis, akpụka nti, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ ị nwereike ikute n'ume","Dịka mbaụwa niile na-ebuagha megide ọrịa coronavirus ugbua, e nwere ọrịa ndị ọzọ a na-esi n'ikuku ebute mama ọtụtụ amaghị maka ha.","Akụko a ga-arụtụ aka n'ụfọdụ ọrịa ndị a nakwa njirimara ha. 1 - Covid-19 Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) nọọrọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị na-ekwu na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa. Nke a bịara dịka ndị Sayensị ruru narị abụọ boro WHO ebubo na ha ejighi nyocha sị na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa kpọrọ ihe. Mana WHO mechara kwete na nyocha a ma kwuo na ọrịa covid-19 nwereike isi n'ikuku efesa ọkachasị ebe igwe mmadụ nọ n'ogige ikuku adịghị. Kama ha sị na ha ka na-eme nyocha ha. Njirimara ọrịa Covid-19 Lee njirimara ọrịa dịka ndị BBC siri dee bụ 2 - Azụzụ Okenye nwereike ibute azụzụ ugboro anọ n'otu afọ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ nje sị n'ezinaụlọ nje asaa nke gụnyere nke Rhinoviruses, so na-ebute ọrịa azụzụ. Nje ndị a ruru otu narị na iri isii n'ọnụ ọgụgụ ma nwe kwa ike ịgbanwe onwe ha maọbụ zọọ n'ime ahụ mmadụ nke na-eme ka o sie ike igbu ha. Dịka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ sayensị chebere ihu ha ịhụ na nje azụzụ enweghị ike ịkpa ike n'ahụ mmadụ kama enweghị ọgwụ eji agwọ ọrịa azụzụ. Njirimara ọrịa Azụzụ Dịka ndị BBCPidgin siri dee, lee ihe e ji mara ọrịa azụzụ 3 - Okponọha Ọrịa okponọha bụ ọrịa ọzọ sị n'ikuku efesa nke dị Bekee na-akpọ Ifluenza. Ọ bụ nje Virus na-ebute ya. 'Menthol' ọ na-egbochi ọrịa coronavirus? Ọrịa a na-agbanwe onwe ya nke mekwara ka ọgwụgwọ ya sie ike. Okponọha gburu ihe ruru mmadụ otu nde narị site n'afọ 1918 ruo 1920, ọ na-akacha njọ n'oge udu mmiri. Njirimara ọrịa okponọha 4 - Kịtịkpa Kịtịkpa bụ ọrịa nje vịrụs na-ebute. A na-akpọ ya Chickenpox na Bekee. E nwere ọgwụ mgbochi a na-agba ụmụaka maka ya site n'otu afọ ruo afọ iri na abụo. Ọ bụ site n'ụkwara na uzere ka e nwereike iji butee maọbụ kesaa ya. Njirimara ọrịa Kịtịkpa Dịka e siri dee, njirimara Kitikpa bụ A hapụ ya, o nwereike imetụta ụbụrụ maọbụ bute oyi ọtụtu nke nwereike ibute ọnwụ. 5 - Akpụka nti Ọrịa akpụka ntị bụkwa ọrịa ọzọ na-efesa n'ikuku nke ọ bụ nje na-ebute ya. Dịka ndị BBC siri dee na ọrịa akpụka nti na-efesa etu ọrịa azụzụ na ndị ọzọ sị efesa nke gosiri na asụ pụtara n'ọnụ onye nwere akpụka ntị banye n'ọnụ onye ọzọ ga ebunye onye ahụ ya bụ ọrịa. Enwere ọgwụ mgbochi eji maka ya bụ ọrịa. Njirimara ọrịa akpụkanti 6 - Arụbara Arụbara bụ ọrịa na-esite na nje virus awakpo ndị mmadụ. BBC dere na ọ bụ site na asụ mmiri sị n'ụkwara, uzere ma mmetụta. Nje arụbara nwereike ị nọ n'ikuku ọtụtụ awa. Ọrị a na-enye ụmụaka nsogbu karịa mana ọ na-emekwa ndị okenye ahụ ha esighịike iluso nje ọgụ. Arubara nwereike ibute ọrịa ndị dịka ọrịa ntị, akwụkwụ, afọ ọsịsa, oyi ma nwereike imetụta ụbụrụ. Njirimara ọrịa Arụbara 7 - Ụkwara tịkotịkọ Nke a bụ ọrịa sitere na nje Bacteria. Ọ na-esikwa n'ikuku ekesa site n'asụ maọbu ụkwara. Ị makwa ọrịa ndị i kwesiri igbochi n'oge udu mmiri a? Mgbe mmadụ si n'imi kuru ihe nje a ka ọ na-enute ọrịa ụkwara nta. Ọ kacha eme ma na-egbu kwa ụmụaka mana enwere ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa. Njirimara ọrịa ụkwara tịkotịkọ Ndị BBC dere na njirimara ọrịa dị ka nke azụzụ 8 - Ụkwara nta Ụkwara nta nke bekee na-akpọ Tuberclosis bụ nje Bacteria na-ebute. Ọ bụ mgbe onye bụ ọrịa a kwọrọ ukwara maọbụ maa uzere ka ndị ọzọ nwereike ibute ya. BBC dere na ọ siri ike ibute ọrịa ụkwaranta kama ọ bụrụ na onye bu ya anataghi ọgwụgwo, ọ na-egbukarị onye ahụ. Ọrịa ụkwaranta kacha emetụta ngụ mmadụ, kama ọ na-emetụta kwa ọkpụkpụ mmadụ, afọ na eriri nsiụbụrụ. Njirimara ọrịa ụkwara nta" afirika-48747353,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48747353,Innoson vs EFCC: Iwu Ụlọikpe nyere ka a kpụta Innoson gbara anyị gharịị' - Cornel Osigwe,Ụlọikpe ukwu dị na steeti Legọs enyela iwu ka anwuchie Innocent Chukwuma bụ onye eji Innoson mara ma kpụta ya n'ụlọikpe.,"Innocent Chukwuma Ọkaikpe Ayokunle Faji nyere iwu a taa bụ Mọnde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun afọ 2019. Mana Cornel Osigwe bu ọnụ na-ekwuru ""Innoson Group"" gwara BBC na iwu ahụ ụlọikpe nyere gbara ha gharịị. Osigwe kwuru na onweghi akwụkwọ ọbụla ha nwetara gosiri na ụlọikpe na-akpọ ha oku ikpe a. O kwukwara na ha ewepulari okwu ahụ n'ụlọikpe mkpegharị bụ ""court of appeal"" kamgbe. Maazị Osigwe sị na ha che na ihe a mere bụ usoro a chọrọ iji mee ka Innoson bịa ka ya na ụlọakụ ahụ kpaa nkata. Nke a abụghị nke mbụ ụlọikpe na-enye iwu ka ejichie Innoson n'ihi okwu dị n'etiti ụlọọrụ ya bụ 'Innoson Group' na otu ụlọ ọbaego ama ama. Ngalaba ""Economic and Financial Crimes Commission"" (EFCC) etinyelarị ọnụ n'okwu ahụ mana a ka nọkwa na ya. EFCC na-ebo Innoson ebubo na o ji akwụkwọ adigboroja wee ga gbaziri ụlọ ọbaego ahụ nnukwu ego. Ha sị na nke a megidere iwu Naijiria. Mana Innoson kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu kama na ọbụ ụlọ ọbaego ahu ji ya ụgwọ ruru ijeri naịra abụọ na ụma." afirika-43946224,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43946224,Inec: Nsogbu dị na mkpọghachị onye omeiwu,"Site na ihe ọgbaghara dị na mkpọghachị achọrọ ime Sịnetọ Dino Melaye na ọdịda ya, Inec ekwupụtala nsogbu dị n'usoro mkpọghachị ndị umeiwu.","Ndị otu PDP na ndị patị ndị ọzọ nọ n' ụlọ nta omeiwu na-esi ọwụ ka emegharia usoro ntuliaka ọchịchị na Naịjirịa Mgbe BBC Igbo gbara Kọmishịọna ndị Inec nke Enugwu Steeti bụ Emeka Ononamadu ajụjụ ọnụ banyere nke a, o kwuru na usoro mkpọghachị ndị omeiwu gụnyere; Ndị a ana-achị bụ ndị ga-eru pesentị iri ise na ọma n'ime ndị mere ntuliaka ga-enwe mkpebi na ha chọrọ ịkpọghachị onye omeiwu. Ha ga-abịa n'ụlọọrụ Inec were akwụkwọ mkpesa bụ ebe ha ga-edeba aha na akara odide ha. Mbinyeaka ikpeazụ Naijirịa mere bụ n'afọ 2015 Inec ga-enyocha akwụkwọ mkpesa ahụ, aha ha nakwa akara odide ha ma hiwe ụbọchị a ga-eme ntuliaka mkpọghachị onye ahụ bụ 'Referendum'. Ọ bụrụ na ndị kwere karịa ndị na-ekweghị, Inec ga-anata onye ahụ Asambodo ọchịchị bụ ' Certificate of Return'. Inec ga-ahazị ụbọchị ọhụrụ maka ntuliaka onye ga-anọchị anya omeiwu ahụ. Ononamadu kwuru na ọ bụ ndị omeiwu hiwere usoro a nke mere na ọdịghị mfe ịkpọghachị onye omeiwu n'ọchịchị. O kwukwara na ọ na-efu ọtụtụ oge nakwa ego iji nyocha ma mee ntuliaka iji kpọghachị onye omeiwu. Ononamadu kwuru na ọ bụ ma ọtụtụ ndị mmadụ chịkọtara aka ọnụ kwuo na ha chọrọ ịkpọghachị onye ahụ, ga-eme ka o kwee omume. Gere ihe Emeka Ononamadu kwuru ebe a: Inec: Nsogbu dị na mkpọghachị onye omeiwu" afirika-50514446,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514446,Sexual Education: Ihe ise ndị nwere amụ kwesiri ịma maka ya,Ọtụtụ nchọpụta apụtala maka ndozi ọtụ ụmụnwaanyị.,"Mana nchọpụta nke a bụ maka etu esi elekọta amụ, akpa amụ na ihe gbasara akụkụ ọmụmụ nwa nwoke. Dọkịnta na-ahụ ma maka ọmụmụ amụ na akụkụ ọmụmụ ụmụnwoke bụ Dọkịnta Chuks Osegbe akọwapụtala ihe ise onye ọbụla nwere amụ kwesiri ima. Ọ sị na amụ bụ otu ihe dị n'ahụ nwoke na adịghị n'ahụ nwaanyị. Mana ugbua, e nwere ndị na-abụghị nwoke na-enwe amụ, mana ọ bụghị akụkọ anyị taa. Ngwa bute oche gụọ ihe ndị a dọkịta Osegbe kpọpụtara dịka ihe i kwesiri ịma maka amụ ụmụnwoke, ihe Beke kpọrọ 'Penal Care': 1. Amụ na-agbajinwu agbaji dịka ọkpụkpụ Ọtụtụ ụmụnwoke na-eche na amụ adịghị agbajinwu agbaji. Ụfọdụ akpọla ya akwara. Mana dọkịta Osegbe kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu. Mgbe amụ ga-agbajinwu agbaji dịka ọkpụkpụ bụ mgbe o keliriekeli. Ya mere Osegbe ji dụọ ọdụ na a ga-ejiri nwayọọ na-ara ọtụ ma amụ gị kenie ka ọ ghara ị gbajipụ 2. Iji amụ pịasie ọkụ ike abụghị ihe na-atụba nwaanyị ime Dọkita Osegbe kwuru na ọ bụ uhe (sperm) 'zuruoke' na-eme ka nwaanyị tụrụ ime ma ọ banye n'ọtụ, ọ bụghị etu i si lasie ọtụ ike. 3.Nkeli amụ na ibu amụ Ọ bụghị nkeli amụ na-ebute ibu amụ. Nnukwu amụ kelie, o nwereike ibutu Ibu, ebe obere amụ nwereike ibu karịa etu ọ ha ma o kelie. 4.Amụ na-agba ọbara maọbụ chagharịa agbaghị aka Mgbe ọbụla amụ bidoro gbawa ọbara, mara na enwere ebe mmiri si baa opi ụgbọgụrụ. Dọkịta Osegbe kwuru na nke a gosiri na ọria emetụtala amụ. Ọ na-adụkwa ọdụ ka nwoke ọbụla chọpụtara ụdịrị ihe a maọbụ ọziza, ịkọ ọkọ (ọkọ T-Junction), nchagharị etu amụ si acha, gaa nyochaa n'aka dibịa ahụike ka ọ mara ụdịrị ọrịa ọ bụ ma nweta ezi ọgwụgwọ. 5. Amụ na-akwụ ọtọ mgbe niile kwesiri ka a gbatara ya ọsọ enyemaka Nwanne ọ bụrụ na mgbe ọbụla amụ gị na-ekeli ekeli, tụmadị mgbe ị naghị ara ọtụ, dọkịta Osegbe kwuru na nke a adịghị mma. O kwuru na amụ nọ na nkeli mgbe ọbụla, ga na-agabiga ụfụ dị egwu. O kwuru na ihe na-ebutekarị ọnọdụ a bụ ụmụ ọgwụ ụfọdụ ụmụnwoke na-aṅụwa maka ikwalite ịra ọtụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-43692473,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43692473,Akụkọ kachasi n'abalịa: Otti ọ ga-emeri Ikpeazụ na 2019?,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa. Ọchịchị Abia steeti na 2019,"Okezie Ikpeazu weere oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Alex Otti zọburu ọkwa ọchịchị gọvanọ Abịa steeti n'afọ 2015, ekwuola na ọ ga-emeri Okezie Ikpeazụ ọzọ na ntuliaka nke 2019. Otti kwuru ọ mụrụla akọ site n' ihe mere ya na ntuliaka afọ 2015. Ndị nwụrụ na Ghana Enwela ọtụtụ ihe mberede n'ogige ngwupụta ọlaedo na Ghana. Ụlọọrụ ebe a na-egwupụta ọlaedọ dị na na Brong Ahafo nke dị nso Accra na mpaghara ndịda nke mba Ghana adaala, gbuo mmadụ isii ma merụọ mmadụ abụọ ahụ. Ihe mberede a mere n'ogige Newmont bụ ụlọọrụ Amerịka nke kachasị emepụta ọlaedo n'ụwa. Na mba ofesi Donald Trump boro ndị isiala mba Syria na Rọshịa ebubo maka ihe mere na Syria Onyeisiala mba America bụ Donald Trump akatọola ndị mba Syria maka ebubo eboro ha na ha ji ngwaagha kemikal gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo Douma ụnyaahụ. Trump boro onyeisiala mba Syria bụ Bashar al-Assad nakwa Vladimir Putin bụ onyeisiala Russia ebubo na ha ma ihe gbasara mwakpo a. N'akụkọ egwuregwu Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu nke isii kamgbe o jiri bụrụ onye Arsenal Ndị Arsenal ji ọkpụ atọ nke Southampton satara abụọ wee merie n'asọmpi premier league ha gbara na mgbede a. Pierre-Emerick Aubameyang bu ụzọ nyere ndị Arsenal goolu, nke bụ nke isii ọ na-enyere ha kamgbe e ji zụta ya n'ọnwa Jenụwarị. Achụpụrụ Mohamed Elneny bụ onye Arsenal nakwa Jack Stephens bụ onye Southampton n'ime asọmpi ahụ. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka" egwuregwu-44525979,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44525979,World Cup 2018: Ịngland ejirila 2-1 merie Tunisia,Kane nyere goolu abụọ ka Ịngland meriri Tunisia 2-1 n'egwuregwu tọrọ ụtọ na-atụghị ụra maọlị.,"Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba. E gbuchiela bọọlụ. Ndị Tunisia nwara ike ha, gbaa ezzigbo bọọlụ dịka ha kwesịrị, mana ndị Ịngland eburula ebube site na goolu abụọ ha nyere. Ndị Ịngland buliri Iko Mbaụwa n'afọ 1966 Nkeji 90: Ịngland ewepụla Lingard tinye Dier. Nkeji 90: GOOOOLLLLUUUU! Kane enyela goolu. Nke a ga-eme ya goolu abụọ o nyerela n'egwuregwu a, Nkeji 88: Loftus-Cheek eburula bọolụ bata n'ihu poostu Tunisia, mana ọ gbanyere Ben Mustapha bọọlụ n'aka. Nkeji 87: Ndị Ịngland na-enye ndị Tunisia ezigbo nsogbu n'ihu poostu. Goolu ọzọ a ga-aga? Ka anyị na-ele anya. Nkeji 84: Tunisia ewepụla Khazri, tinye Khalifa. Mgbanwe atọ ha kwesịrị ime ezuola oke. Nkeji 82: Rashford enwetarala Ịngland 'corner'. Young gbara ya mana Ben Mustapha ji aka supu ya tupu o metụ n'isi Stones. Nsupu a o mere, emerụọla ya ahụ n'aka, mana agahị ewepụ ya. Nkeji 79: Ewepụla nwaafọ Naịjirịa na-agbara Ịngland bụ Dele Alli, tinye Loftus-Cheek. Nkeji 78: Young agbafuola 'free kick' ya. Bọọlụ gbafere n'elu poostu. Nkeji 77: Ịngland enwetala 'free kick' n'ihu poostu Tunisia ka agbaturu Alli. Young ga-agba ya. Nkeji 73: Tunisia ewepụla Sliti tinye Ben Amor. Nkeji 71: Sliti agbaala shọọtụ n'ihu poostu Ịngland, mana ọ bataghị. Nkeji 68: Trippier agbaala 'free kick' ha mana bọọlụ dapụrụ n'ezi. Nkeji 67: Ịngland ewepụla Sterling tinye Rashford ka ha na-achọ ịgba 'free kick' n'ihu poostu Tunisia. Nkeji 60: Ịngland agbaala 'corner' ha mana isi apụtaghị. Nkeji 59: Trippier ebutela bọọlụ, mana shọọtụ ọ gbara pụrụ 'corner' ka onye Tunisia tinyere ya ahụ. Nkeji 54: Ndị Tunisia na-acha ndị Ịngland ọkụ dị egwu. Nkeji 51: Trippier agbaala 'corner' ha mana Ben Mustapha ghọrọla ya. Nkeji 50: Ịngland enwetala 'corner' ka oche goolu ndị Tunisia ji ụkwụ gbapụ bọọlụ. Nkeji 46: E bidola ọkara nke abụọ. Nkeji 45 na ụma: Egbuchiela ọkara nke mbụ ka ndị mmadụ gaa ezumike nkeji 15. Otu abụọ a ka na-agba 1-1. Nkeji 45: Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji atọ maka oge e gburu ka Hassen nọ na-anata ọgwụgwọ. Nkeji 44: Lingard abịakwala ọzọ n'ihu poostu, Ben Mustapha gbapụtara na poostu ya, mana ụkwụ poostu azọọla ha ka bọọlụ biri ya pụọ. Nkeji 42: Lingard agbaala shọotụ n'ihu poostu, mana ọ banyeghị. Nkeji 38: Bọọlụ erutela n'ihu poostu ndị Tunisia. Ọ banyeghị etu ndị Ịngland si chọọ. E ji VAR nyochaa ya mana isi apụtaghị. Nkeji 35: GOOOOOOLLLLUUU! Ferjani Sassi enyela goolu. Nke a ga-eme ya goolu mbụ ndị si Afrịka ga-enye n'asọmpi a na-abụghị nke ha nyere onwe ha 'own goal'. Nkeji 34: Ogbu bọọlụ enyela ndị Tunisia penariti. Sassi ga-agba ya. Nkeji 33: Walker agbatuola Fakhreddine Ben Youssef. A na-enyo ihe nkiri VAR ịmata ma a ga-enye ndị Tunisia penariti. E nyere Walker akwụkwọ edo edo. Nkeji 30: Maguire ataala isi gara nso neetị, mana Ben Mustapha ghọrọla ya. Nkeji 23: Khazri agbaala shọotụ gafere elu poostu. Nkeji 18: Walker bunyere Trippier bọọlụ, Tripper agbaa shọọtụ n'ihu poostu. Henderson butere bọọlụ a gbakwaa ya na neetị mana Ben Mustapha ghọrọla ya n'ala. Nkeji 15: Ewepụla Hassen, tinye Ben Mustapha. Ọ pụtara na ada ọ dara merụrụ ya ahụ n'uvu ya. Nkeji 11: GOOOOLLLLUUU! Kane agbakaala neetị site na 'corner kick' ha gbara. Nkeji isii: Hassen bụ oche goolu ndị Tunisia adajiela onwe ya, mana enyela ya ọgwụgwọ. Nkeji anọ: Maguire enwetala ohere iji isi taa bọọlụ, mana Hassen tinyere onwe ya mere ka ụkwụ Kane ghara inweta ya. Nkeji atọ: Lingard nwetara ohere ịgbaka neetị ndị Tunisia, mana Hassen ekweghị ya. O ji ụkwụ gbafee ya poostu. Otu Nkeji: Egwu ebirila ọkụ ugbua n'ọgbọ egwuregwu Volgograd. Ndị nọ n'oche Tunisia: Farouk Ben Mustapha, Yohan Benalouane, Oussama Haddadi, Rami Bedoui, Saif-Eddine Khaoui, Mohamed Ben Amor, Ahmed Khalil, Aymen Mathlouthi, Bassem Srarfi, Saber Khalifa, Ghilane Chaalali, Hamdi Nagguez. Ndị nọ n'oche Ịngland: Danny Rose, Eric Dier, Jamie Vardy, Jack Butland, Danny Welbeck, Gary Cahill, Phil Jones, Fabian Delph, Marcus Rashford, Ruben Loftus-Cheek, Trent Alexander-Arnold, Nick Pope. Ndị Tunisia bidoro bọọlụ: Mouez Hassen; Dylan Bronn, Syam Ben Youssef, Yassine Meriah, Ali Maaloul; Fakhreddine Ben Youssef, Ellyes Skhiri, Ferjani Sassi, Anice Badri; Wahbi Khazri; Naim Sliti. Ndị Ịngland bidoro bọọlụ: Jordan Pickford; Kyle Walker, John Stones, Harry Maguire; Jordan Henderson; Kieran Trippier, Jesse Lingard; Dele Alli, Ashley Young; Raheem Sterling, Harry Kane. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Ịngland ga-emeri Tunisia n'egwuregwu a. Kedụ ihe ị che? Ndewo! Daalụ maka isonye anyị n'egwu a." afirika-45319234,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319234,Ezeife: 'Restructuring ga-eme ka Igbo ga n'ihu karia,Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife ekwuola na ihazigharị Naijiria na mpaghara ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ karịa ịchọ ọkwa onyeisiala.,"Okwu Ezeife sochiri oku Igwe Alfred Achebe, Obi Ọnicha kpọrọ ka ahazigharị Naịjirịa ka mpaghara ọbụla gbaba mbọ onwe ha. N'okwu ya, Ezeife sị ""Ọ bụrụ na ekewasia anyị nọrọ be anyị, ọ gaghị enwe onye ya na ibe ya ga na-ese, ndị ọbụla a nọrọ be ha dozie be ha."" Ọ gara n'ihu kọwa na ""Anyị nweta ọkwa onyeisiala, ọ chịcha pụọ, anyị etiwekwa mkpu. Mana alaghachi azụ n'ebe anyị nọ na mbụ na 1954 bụ na mpaghara(region) oge Okpara na Awolowo na-achị, ọ bụ oge ahụ enweburu ọchịchị na mpaghara ka Naijiria nwere ọganihu, ọ ga-aka anyị mma."" Cheta na Igwe Achebe kwuru mgbe ọ gara ikele gọvanọ na-achị Plateau steeti bụ Simon Lalong na e kwesiri ịhazịagharị Naịjirịa etu ọ ga-adị ka mpaghara niile nwe ike na-enye onwe ya nri, na abụghị ị na-eche ka gọọmentị etiti nye ha. Ọ sara ajụjụ maka inye onye Igbo ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 wee si na udiri ihe ahụ abụghị nke dị mkpa. Igwe Achebe sị na-ekwesịghị ịna ekwu okwu ma onye ga-abu onyeisiala ọ bu onye Igbo, onye Hausa maọbu onye Yoruba, makana ihe kachasị mkpa bụ i hụ na onye banyere n'ọkwa ga-eme onye ka ibe ya. ""Ekweghị m na atụmatụ onyeisiala Igbo, Yoruba maọbụ Hausa. Ọ na-ada ka ihe nkewa; makana ihe anyị chọrọ bụ onyeisiala ndị Naịjirịa họpụtara ka ọ rụọrụ anyi niile ọrụ."" Igwe Achebe sị na ekwesiri ịkewa Naịjirịa n'udi ndị Briten si kewa ya mgbe ha na-achị Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54359882,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54359882,'Etu e si gbuo ụmụ m n'Ebonyi'- Nwoke e gburu ụmụ ya abụọ,Nwoke Fulani ndị omekome gburu ụmụ ya abụọ na nnukwu ọhịa dị n'Ukwụachi Isieke dị n'Ebonyi steeti ekwuola ka o si mee .,"Nwoke ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ n'elekere asatọ nke mgbede ụbọchị Tuzde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Sepụtemba ka ndị omekome ahụ ọ na-eche na ha bụ ndị Ebonyi biara gbuo ụmụ ya abụọ mgbe ha nọ n'ụra. O kwuru na ha gbukwara ehi atọ. O kwuru na o nweghị ihe na-eseburu ha ndị Ukwuachi. Mana Eze ndị Ishieke bụ Patrick Aloo kwuru na aka ndị obodo ya adịghị n'ogbugbu ahụ kama ọ bụ ndị ori biara wakpo ndị Fulani ahụ n'ime ọhia ebe ha bi, gbuo mmadụ abụọ ma meruo otu onye ahụ. O kwuru na kamgbe afọ iri ha na ndị Fulani na-emekọ ihe, ha enwebeghị nsogbu ọbụla. Onyeisi ndị ntoroọbịa Isieke bụ Chigozie Alo na-ekwusike na onweghị mgbe ndị Isieke ji wakpo ndị Fulani bi n'etiti ha. O kwuru na kamgbe afọ iri na isii ha na ndị Fulani bigoro, ha enwebeghị nsogbu ọbụla. Philip maku bụ onyeisi ndị uweojii n'Ebonyi steeti Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi bụ Odah Loveth wepụtara akwụkwọ ozi kọwara etu ihe a si mee. O kwuru na otu nwoke a kpọrọ Ado Ibrahim bụ onye Fulani na-achị ehi biara kpesa n'ụlọ ọrụ ndị uweojii dị n'Ishieke na mmadụ abụọ ndị omekome gburu n'ogbe ha bụ ụmụụmụ ya. Ado kọọrọ ha na e gburu ụmụ ya mgbe ha na-arahụ ụra n'elekere itoolu nke mgbede Tuzde mgbe ha chichara ehi. Odah depụtara na kọmịshọna ndị uweojii gakwara ebe ahụ ihe a mere ma si ka e mee nnyocha ma chọpụta ndị kpara mkpamkpa a. Ọ na-arịọkwa ka ndị ntoroọbịa nakwa ndị Fulani bi n'Ishieke nọrọ jụụ ghara imalite lusowe onwe ha ọgụ makana ha ga-eme ihe niile ha nwereike ịhụ na eziokwu pụtara ihe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Mgbe ndị Ebonyi mepụtara omenala Igbo" afirika-51459107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51459107,South East Security: Ihe niile i kwesịrị ịma maka otu nche ọhụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere,"Dịka ohi, ntọ na igbu mmadụ dị ka ọ na-arị elu na Naịjirịa, ndị gọvanọ mpaghara dị icheiche ehiwela otu nche nke ha.","Gọọmentị Enugwu steeti hibere otu nche a kpọrọ 'forest rangers' Otu ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha ehiwela otu nchekwa nke ha kamgbe ọnwa Jun 2019. Ọ bụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị 9 nkd Februwarị ka ha kwuru nke a. Nzukọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu Ndị mpaghara ọdịda anyanwụ ehibela otu nke ha a kpọrọ 'Amotekun', ebe ndị mpaghara ugwu nwere nke ha kpọrọ 'shege fa fasa'. Mana ndị otu gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha enwetabeghị aha maka otu nche nke ha hibere ọhụrụ. Lee ihe anyị ma gbasara otu nche ọhụrụ a: Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti yi akwa ndị ọrụ nchekwa Otu jikọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere otu nche a n'abalị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2019. Ụgbọala ndị nche Amotekun Cheta na gọọmentị etiti gbarụrụ ihu oge ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ malitere otu 'Amotekun'. Nke a mere ka ndị mpaghara ahụ ọnụ na-eru n'okwu gara n'obi gọọmentị n'Aso Rock ebe ha nọrọ kapịa ya ọnụ. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị na mpaghara ugwu ekwenyeghi na ọ dị mma ka mpaghara dị icheiche nwee ndị nche nke ha. Mana ndị nkwado atụmatụ na-ekwu na onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ arachaa ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ntaramahụhụ n'aka ndị ọrụ nchekwa." afirika-47019230,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47019230,World Bank Leadership: Ngozi Okonjo-Iweala a na-arọ ọkwa a anya?,Onye bụbụ minista na-ahụ maka mpata na mmefu akụ na ụba Naịjirịa bụ Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola na ọ ga-achịnwụ dịka onyeisioche ụlọakụ mbaụwa maọbụrụ na enye ya ohere.,"Okonjo-Iweala dere akwụkwọ maka mpụ na awaụwọ dị na gọọmentị mgbe ọ nọ ọrụ obodo Okonjo Iweala gwara onye ntaakụkọ CNN nke a mgbe ọ gbara ya ajụjụ ọnụ n'izu ụka gara aga na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ya ma ọ ga-ewe ọrụ dịka onyeisioche ụlọakụ mbaụwa. Ọ gwara Richard Quest na ọ ga-azọ okwa ahụ ma ọbụrụ na ọnọdụ niile gbara usoro e ji azọ oche ahụ gburugburu dị ya ahụ mma. Cheta na onye bụ onyeisioche ụlọakụ mbaụwa bụ Jim Yong Kim tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ya na mbido ọnwa Jenụwarị na-anọzubeghị oge o kwesiri ịpụ n'oche ahụ. Okonjo -Iweala bụkwa onye ọkwa ya gbagotere n'ụlọakụ mbaụwa na Kim zọkọrọ ọkwa onyeisioche n'afọ 2012. Ka ọ dị ugbua, ọ bụ ya ka a na-elegara anya na ọ ga-ebu ụzọ na ndị ga-azọ ọkwa ahụ. Mgbe a jụrụ ya ma o tinyela akwụkwọ igosi na ọ chọrọ izọ ọkwa ahụ, o kwuru ""mba, emebeghịm ya, ị jụrụ ajụjụ, m zakwa gị ya n'ụzọ ziri ezi, obi di m mma."" Kedụ ka esi ahọpụta ndị ga-achị ụlọakụ mbaụwa? Dika e si depụta n'akara webụsaitị ""World Bank, ọ bụ ndị ọkachasị n'ọkwa ụlọakụ ahụ ga-ahọpụta ndị ha chere ga-arụli ọrụ onyeisioche. Ha mecha nke a, ha si na ndị ha họpụtara wee họpụtakwazịa otu onye ga-arụ ya bụ ọrụ. Onyeisioche ""World bank"" esila na mba Amerika pụta ugboro iri asaa na atọ. Mpụta Okonjo Iweala n'afọ 2012 ga-eme ya nke mbụ a na-enwe ndọrọndọrọ n'etiti onye na-esighị mba Amerịka na ndị Amerika na-azọ oche ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53071364,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53071364,Resident Doctors' Strike: Ndị dọkinta Enugwu esorola ibe ha malite abụbọọrụ,Ndị dọkịta na-arụ na ụlọọgwụ nke gọọmenti n'Enugwu steeti esorola ndị ogbo ha na Naijiria niile bagide abụbọọrụ.,"Nchọpụta nke BBC Igbo mere gosiri na ndị dọkịta na-arụ na ụlọgwụ Parklane Hospital, UNTH nakwa Orthopadic Engwu sonyere n'abụbọọrụ ahụ. Onyeisi otu ndị dọkịta('Resident Doctors) na-arụ na Parklane General Hospital bụ Chima Edoga gwara BBC Igbo na ọ bụ iji gbasoo ntuziaka nke otu ahụ nyere ndị dọkịta na Naijiria. Mgbe BBC rutere na ụlọọgwụ Parklane Enugwu, ebe niile tọgbọrọ chakoo n'ihi na ọ bụ nanị ndi isi dọkịnta na-arụ ọrụ. Ọtụ nwaanyị bịara ya bụ ụlọọgwụ aha ya bụ oriakụ Onyinye Okoye kwara arịrị na ka mgbe isi ụtụtụ ka ya bịara ụlọọgwụ ahụ, were nụ na abụbọ ọrụ ahụ dị ire. O kwuru na ha agwaala ya na ndị ọzọ ka ha lawa n'ihi na ọrịa ha abụghị nke gbagbata. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47138918,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47138918,Child bride: Ihe ise mere ndị Igbo ka ji alụpụ nwaada n'oge,"Kemgbe akụkọ nwata nwaanyị dị afọ iri na isii ekenyere di ruola afọ iri ise na ụma jiri wuo na soshal midia, ọ kpalitere ụka banyere ikenye ụmụada etobeghị eto di.","Tupu nke a mere n'Anambara ewuo, ọtụtụ ndị Igbo na-arụkarị ndị Ugwu-Awụsa aka dịka ndị e jiri ịlụ nwata mara. Mana ikuku ekuola, ahụ ike ọkụkọ dịka akụkọ nwata ọzọ a kpọrọ Ebube ,dị afọ iri na-anọ alụnyere nwoke dị iri isii na ise n'otu Anambra steeti. Dịka otu mbaụwa nke a kpọrọ United Nations na bekee siri kwuo, ụmụada ụmụ Naịjirịa alụpụrụ na-erughi afọ iri na asatọ dị nde iri abụọ na atọ (23million). Okwu akpụzi n'ọnụ ugbua bụ gịnị na-ebute ụdị agwa? Ụfọdụ sịrị na ọ bụ ụbịam, ụfọdụ sị na ọ bụ enweghị nghọta, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ ịmụ nwa na mkpụke butere ya. Harrison Emefiele, onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụaka ma bụrụkwa onye otu ya bụ 'Behind Bars' tinyere aka ịgbapụta Chinwe kwuru na ọ bụ agụghị akwụkwọ nakwa etu e si ahụta ndị mụrụ nwa n'alụghị di. ""Chinwe nwere nwa dị ọnwa isii, ebe Ebube nwere nwa dị ọnwa itoolu."" ""Chinwe amụọla nwa oge ndị be Igwilo bịara lụọ ya, ebe Ebube dị ime ka a kwụrụ ụgwọ isi ya kpọrọ ya ga n'alụsị ebe e duru iyi na ọ gaghị ahapụ nwoke lụrụ ya."" Emefiele tụrụ arịrị na ụbịam nakwa enweghị nghọta so ebute nsogbu a. Dịka o siri kọwa, a kpụrụ Chinwe gaa n'alụsi iji duo ya iyi na ọ gaghị ahapụ di ya. Ọ tabiri anya etu mịnịstri ọ dị n'aka si na-akpụ ụkwụ n'ala n'ụdị okwu ahụ. Child bride: Ụbịam so ebute nsogbu iluchu di Komishọna okwu ụmụnwaanyị dị n'aka n'Anambara bụ Ndịdị Mezue ekweghị asa BBC Igbo okwu oge anyị kpọọ ya n'ekwenti. O sịrị: ""ọ bụghị ka anyị sị arụ.. Ị chọọ ka anyị kọrọ gị ihe anyị ma maka akụkọ ahụ, ị bịa n'ụlọrụ anyị."" Mana ndị ji anya okenye ji ahụ ụzọ ele ihe na-arụ aka n'omenala. N'oge gboo n'ala Igbo, a na-alụpụ nwaanyị ọsọ ọsọ. Akụkọ kwuru na nne Chinwe lụrụ dị oge ọ dị afọ 13, nke mere n'ọ hụghị ihe ọjọ dị na nwa ya agaghị alụ di na nwata. Dịka otu onye omenalala doro anya bụ Nze Duruagwu siri kọwara BBC Igbo, ọ na-abụkarị bido n'afọ iri na anọ rue n'afọ iri na-asatọ. Dịka Duru agwụ onye bụkwa Olueze Ukaejuoha, siri kwuo, ihe ndị kpatara nke a bụ na n'oge gboo: 1. Nwaanyị anaghị enwe aka ọrụ 2. Nwaanyị anaghị enwe abọ ahịa n'ụlọ nne ya Nke a pụtara na gboo nwaanyị anaghị anọ be nna ya na-akpata akụ na-edowe dịka ọ dị ugbua. 3. Ihe ana- akwado nwaanyị bụ naanị ka ọ ga-esi bie be di ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43130435,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43130435,Uweojii nke steeti: Buru ụzọ dozie uweojii nke fedralụ,"Kamgbe osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo kwetechara na gọọmentị etiti na-agba mbọ ikewapụta uweojii nke steeti, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akatọọla ya bụ mkpebi.","Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị Ụfọdụ sị na ọ ga-ekewa Naijirịa ebe ndị isi steeti iri atọ na isii dị n'ala Naijịrịa kwetere na ya bụ nkewapụta uweojii steeti. Ha gbadoro ụkwụ na ọ ga-eme ka echekwaa ime obodo ọfụma. BBC Igbo gbara otu onye uweojii nọ ezumike nka n'Enugu steeti akpọrọ Emmanuel Ojukwu, ajụjụ ọnụ. Ojukwu kwuru na kama ikewapụta uweojii nke steeti, na ọ ga-adị nma ka gọọmentị etiti kwado uweojii nke fedralụ na ngwaọrụ, ọzụzụ, ndụmọdụ na itinye ego. Ọ sị kwa na ọbụru na Naijirịa na-achọ ịdị ka mba ndị ọzọ kewapụtara uweojii nke steeti, na ọ gaghị adabacha n'ihi na mkpa Naijirịa na nchekwa abụghị otu na ebe ndị mba ndị ọzọ nọ. ""I kewapụta uweojii nke steeti, ihe mere anya ga-eme imi."" Gere ihe Ojukwu kwuru n'uju ebe a: Onye kọmishọna uweojii nọ ezumike nka kọwapụtara uche ya gbasara uweojii steeti" afirika-49480722,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49480722,Cyber Crime Victim: Etu onye 'yahoo yahoo' si chọọ iri m' Amy Yoakum,Igbo si na eburu ozu onye ọzọ ọ dị ka ebu ukwu nku.,"Ndị EFCC boro ebubo izu ohi ịntanetị. Dịka akụko na-aka mma na ọnụ onye o mere, akụko a na egosi ụfọdụ ndị umu 'Yahoo yahoo' riri ego ha. Ka anyị bido na ofesi. AmyYoakum si na ndị yahoo yahoo ghọgburu ya Amy Yoakum kwuru na onweghi uru di na izu ohi Amy Yoakum bụ onye Ameịrka sị na steeti California. Ọ kọrọ anyị etu ya na onye ohi ịntaneti bụ nwaafọ Naịjiria siri gbarịa. Yoakum kwuru si: ""ọ bụ na websaịt a na-achọta enyi nwoke (dating site) ka m zutere nwoke a."" ""O tinyere foto gosiri na ọ bụ onyeọcha n'Amerịka bi na steeti na-eteghi aka ebe m bi. ""Ọ gwara m na ọ bu onye Injinia (Engineer) nke nọ Naịjrịa na-arụ ụlọ akwụkwo. ""Ọ gwara m ihe niile m chọrọ ịnụ nke mere ka m hụ ya n'anya, ọ dịzi ka ọ bụ sọosọ m bụ nwaanyị nọ n'uwa a."" Yoakum gakwara n'ihu kwuo na mgbe ha na-akpa n'ekwentị, n'asụsụ nwoke a adịchaghị ka nke onye Amerịka. Nke a mere ka ọ jụwa ajụjụ. Ọ gara nnyocha na intaneti wee hụta maka ndị ji ịntanetị ezu ohi, ọ kachasị nke ndị enyi nwoke na nwaanyị. Yoakum gwara nwata nwoke ahụ na ọ matala ebumnobi ya. Nwa amadị ahụ rịorọ ya mgbaghara ma kọwaara ya na o jighi ego ma ihe niile. Yoakum kwuru na o mechakwara nye nwoke ahụ ego site n'obi ebere. Kama otu enyi ya nwaanyị danyekwara n'aka ndị yahoo, e rie ya Dọla puku iri abụọ na ise ($25,000). Amy Yoakum nyere umunwaanyị ibe ya ndụmọdụ ka ha jiri isi ha mgbe ha na akpa n'intanetị. Na nke Dom Onwuamaeze, mmadụ ṅomiri enyi ya nwoke n'iji ghọgbuo ya Ha ji olu enyi m nwoke ma kpọo m na ekwenti Dom Onwuamaeze siri na nke ya dị ya ka ihe onyoonyoo. Ọ bụ olu o chere bụ enyi ya nwoke ka e ji kpọọ ya n'ekwe ntị gwa ya na o nwere ahịa ha ga-azu wee nwete ego. Onwuamaeze kwuru sị: ""Amaghị na ọ bụ onye ohi n'ihi na aha ya na olu ya yiri nke enyi m nwoke"". Onwuamaeze kọwara na ndị ahụ napụrụ ya puku naịra iri abụọ (N20,000). Ozugbo o nyechara ha ya, ha azaghịzịkwa ya na ekwentị. E siri nghọgbu ozi ghọgbuo Muyiwa Balogun Email adigboroja eziteere Muyiwa Balogun Balogun kwuru na nke ya site n'ozi ""email"" ka ha ji wee rie ya. ""Email"" ahụ kwuru na o nwere ihe mere akara ọbaego m."" ""Ha gwara m ka m tinye akara ọba ego m ma akara nzuzo m ji agbape ya."" ""Mgbe m zaghachịrị ya, enweteghi m ozi na adọrọla ego m niile. ""Nke a mere ka m chee na o nweghi ihe mebiri. ""Kama mgbe m gara ịdọro ego na 'ATM', enweghi shịshị ọbụla fọrọ n'ọba ego m."" Ndụmọdụ ndị uweojii 'Ụfọdụ mgbe ọ na abu anyaukwu na eduba ndị mmadụ n'aka ndị ohi' Ikeokwu Godson Ọnụ na ekwuru ndị uweojii n'imo steeti bụ Ikeokwu Godson nyere ndị mmadụ ndụmodu sị - 1) Onye nwela anyaukwu, nyocha azụmahịa ọbụla tupu i tinye ego gi. 2) Onye wetere ozi 'Email' maọbụ n'ekwenti, onye ahụ were ụkwụ ya gaa n'ụlọaku gaa mee ihe ha si ya mee. Ebe ọnụ na ekwuchitere ndi EFCC bụ Wilson Uwujaren nyere ndi mmadụ ndụmọdụ ka ha: 1) Saa anya na mmiri ma ha enyela onye ọbụla ihe gbasara ọba ego ha. 2) Mmadụ niile nyochaa atụmatụ niile gbasara ego tupu i tinye ego gi. 3) Onye nwetere ozi na ezighiezi detere ha akwụkwọ na info@efccnigeria.org. Akụko ga-amasi gi : Lee ihe nkiri ga-amasị gị Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha" 50879629,https://www.bbc.com/igbo/50879629,Everton vs Arsenal: Ljungberg emeela ike ya mana ozughị,Ihu atọghị ndị nkwado otu egwubọọlụ Arsenal na Everton ọchị taa ka otuegwu bọọlụ abụọ ahụ gbara ọnyụpa na Premie Lig ụbọchị Satọde.,"Freddie Ljungberg ga-apụrụ Mikel Arteta n'oche taa Agbanyeghị, ndị otu abụọ ahụ nụrụ ọgu ka agụowuru abụọ meruru ahụ ebe ọgụgụ sị na ndị Arsenal jidere bọọlụ ihe ruru 57% ebe Everton ji ya 43%. Asọmpi a bụ nke mbụ nke ikpeazụ Freddie Ljungberg ga-eji nyere Mikel Arteta ohere dịka onyeis nkuzi ndị Arsenal. Otu ekwubọọla abụọ agbaghị aka ahịa site na mbido ya bụ egwuregwu ruo na ọgwụgwụ ya nke bụ na ụfọdụ che na ọ bụ ya bụ asọmpi kacha njọ kemgbe agbawara Premia Lig. Ihe atụrụ anya n'aka Mikel Arteta karịrị akarị ọkachasị ikpogote Arsenal n'ogogo Premia Lig bụ ebe ha na-agba ndị nke itoolu. Onye jigodi oche onyenkuzi ndị Everton bụ Duncan Ferguson na-aja onwe ha ike na-ekwu na ha mere ike ha ịhu na Arsenal emerighị ha n'ụlọ. Nke a bụ ugboro atọ emeribeghị ha n'asọmpi. Obi juru ya afọ maka ihe ndị otu ya gbara taa, agbanyeghị na ha emerighi, ebe ọ na-atụanya ịnabata onye ndụ ọhụrụ ha bụ Carlo Ancelotti echi. Egwuregwu a ka ndị na-anọchite anya ndị nkuzi otu abụọ a bụ Freddie Ljungberg na Duncan Ferguson ga-eji nyere ndi isi ha efe n'oche. Ndị nkuzi abụọ a nọkwanụ n'ụsọ ekiri ihe ndị otu ha mere n'ọgbọ bụ ebe ha ga-anọ mara ihe ha ga-eme iji mee ka ọnọdụ ha gbagote. Ọnweghị ndị nwere ibe ha goolu ka ya bụ asọmpi gwuchara. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54307626,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54307626,"Eji m N5,000 azụta ikuku 'oxygen' kwa ụbọchị - nwaanyị na-enweghi ike iku ume","Ị gwa mmadụ na o nwere onye dị ndụ na-azụta ume ọ na-eku, ụfọdụ agaghị ekwe.","Mana ọ bụ ihe otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ ya aha a ma dịka ""Nwachukwu"" na-agabiga. Mgbe BBC gara gbaa ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya, o ji anya mmiri na obi mgbawa kwuo sị ""Chineke nyere m aka gabiga ọnwụnwa a"" I lee ya anya n'ahụ ị ga-ahụ na akpụkpa ahụ ya na-eji oji mana ihu ya na-acha ọcha, ị ga-anụkwa mkpọtụ igwe nkutu ụme nke o ji eku ume. Ọ bụ mgbe ọrịa rịara m ka ndị dọkịta gwara m zụta nke ya bụ igwe nkutu ụme maọbụrụ na m chọọ ịdị ndụ. Ọ zụrụ nke mbụ N650,000 mana a na-edozi ya ugbua. Ọ zụrụ nke abụọ bụ N350,000. Ọ zụkwara nke ejighi ọkụ latrịk arụ ọrụ bụ N65,000 ma jiri kwa N15,000 zụta 'oxygen'. Ọ zụkwara nke a na-akwọ n'azụ ka nwa ọhụrụ bụ N200,000 maka mgbe ọ ga-eji chọọ ịpụ apụ. ""E nwere m dọkịta anọ na-agwọ m ọrịa a, a na m emefu N70,000 kwa ọnwa. ""Aha ọrịa m na-arịa bụ Pulmonary hypertension, nke na-eme ka ọbara ghara ịrụ mkpụrụ obi ka o si kwesi"" ka Nigerian Goddess kọwara. Ọrịa ahụ malitere ị rịa ya mgbe ọ dị naanị afọ atọ ""akpụkpa ahụ m bu ụzọ gbajie oji tupu e mee nyocha chọpụta aha ọrịa ọ bụ"" ka o kwukwara. ""Ụfọdụ ndị dọkịnta gwara m na enwere m ike ịgbake n'ọrịa a mana ụfọdụ gwakwara m na m ga-aṅugide ọgwụ rue ọnwụ m."" Nwaanyị a kọwara na di ya chụrụ ya na ụmụ ise ya maka ọrịa a. O kwukwara na ọ dịghịrị ya mfe ị kwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, nye ha nri nakwa kwụọ ụgwọ ụlọ n'ihi ọrịa. ""Onye nwe ụlọ ezitela ozi sị m kwụọ ya ụgwọ ụlọ nke afọ mana amaghị m ebe m ga-esi nweta ego ahụ."" Gụnyere n'ịzụta ume ọ na-ekwu kwa ụbọchị, ọ na-aṅụkwa ọgwụ ruru mkpụrụ ise kwa ụbọchị nke ụfọdụ n'ime ya ruru N4,000." afirika-45828722,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45828722,2019 Election: Mkpezi Obasanjo na Atiku. kedụ ihe ọ pụtara?,Ụlọọrụ onyeisiala edepụtala n'akara twitter ha na ọ gbagọjughị anya na onye bụbụ onyeisala bụ Olusegun Obasanjo tụgharịrị azụ na-akwado Atiku Abubakar.,"Atiku bụ onye meriri na ntuliaka imeụlọ ndị PDP mere iji wee họpụta onye ga-azọ oche onyeisiala na pati ahụ. Garba kwuru,""Otebeghị aka Obasanjo na Atiku lụchara ọgụ maka ebụbọ mmerụaka. Ụmụ Naịjirịa agaghị echezọ nke ahụ."" ""Ụmụ Naịjirịa nwere ntụkwasị obi na ebe Buhari nọ makana ha ma na ọ nọghị n'ọkwa onyeisala maka uru ọ ga enweta."" Shehu kwuru na ha nabọ ga-adawa isi. Ka o depụtachara ihe a na Twitter. Lee ihe ndị mmadụ sara ya. @ab_akam kwuru na ọ gbagọjuru ya anya ka Garba Shehu ga-esi naedepụta akwụkwọ makana Atiku na Obasanjo kpeziri esemokwu ha. @JShoremekun kwuru na ụwa nwere ka ọ dị makana Garba Shehu na-ekwuchiteburu Atiku ọnụ na-atụfeziri ya okwu. @edumontee kwuru na ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ezigbo ihe. Cheta na Obasanjo, Atiku, Bishọp Oyedepo, Bishọp Kuka na Sheik Gumi nwere mkparịta ụka na Abeokuta, Ogun steeti n'ụbọchị October 11, 2018. Onye bụbu onyeisiala bụ Olusegun Obasanjo agbagharala onye bụbu osote ya bụ Atiku Abubakar dịka ọ bịara njem nleta n'ụlọ ya. N'ime nzukọ ha mere taa, Obasanjo kpọrọ Atiku 'Onyeisiala ọzọ na-abịa'. Ndị ọzọ so n'ọgbakọ ahụ gụnyere onye bụbu gọvanọ Ogun steeti bụ Otunba Gbenga Daniels, Uche Secondus bụ onyeisi pati PDP. ndị ọzọ bụ Onyeisi ụka Winners Chapel bụ Bishọp David Oyedepo na Bishọp ụka katọlik na Sokoto bụ Mathew Kukah, onye ndu ndị alakụba bụ Sheik Ahmed Abubakar Gumi. Obasanjo ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ihe ha kparịtara n'ọgbakọ ahụ. Cheta na oge tupu oge a eruo, na Obasanjo kwuru na Chineke agaghị agbaghara ya maọbụrụ na ọ kwado atiku ịbụ onyeisiala. Atiku kelere Bishọp Oyedepo maka ịkpere ya ekpere pụrụiche: O kelekwara Obasanjo maka ị na-abata ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52375566,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52375566,Coronavirus: Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị na-achọ igbochi ịtụrụ ime na 'lockdown' a ọ na-arị elu?,Ọ bụ ihe aṅụrị ma nwaanyị lụrụ di tụrụ ime maka na nwa so n'isi sekpuntị na alụmdi na nwunye.,"Nwaanyị dị ime Mana ụfọdụ ụmụnwaayị lụrụ di na-aṅụzị ọgwụ ga-egbochi ha ịtụrụ ime ọkachasị n'oge mmachi ngagharị a n'ihi coronavirus. N'oge a, ha na di ha na-anọkarị n'ụlọ nakwa enwe mmerịkọta kwa mgbe kwa mgbe, mana ha achọghị ka ""aka enwe ghọọ aka mmadụ."" BBC Igbo kpọtụrụ Nọọsụ Comfort Ogu bụ onyeisi nhazi n'ụlọọrụ 'Planned Parenthood Federation of Nigeria' ngalaba Abia Steeti. Ọ sị na ụmụnwaanyị na-abịa n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha na-anara ọgwụ maka nhazi ezinaụlọ bụ 'Family Planning' kamgbe 'lockdown akarịala ndị na-abịa n'oge mbụ. Ogu kwuru sị: ""Na-agbanyeghi na anyị anaghị emepe ụbọchị niile maka mmachi ngagharị, ọtụtụ ụmụnwaanyị na-akpọ anyị n'ekwentị maka ị nara ọgwụ mgbochi ime."" ""Ndị na-abịa a nara ọgwụ mgbochi ime ugbua ga-eji ihe ruru pasentị iri isii karịa ndị na-abịa n'oge nkịtị."" Ogu sị na ọgwụ ụmụnwaanyị ndị a na-anara gụnyere ọgwụ ọṅụṅụ, nke ọgbụgba nakwa nke a na-etinye etinye. Etu e si eme 'hand sanitizer' BBC Igbo jụrụ otu dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Joseph Akinde etu o sị hụta atụmatụ a ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agbaso. Ọ sị na atụmatụ ha a dị mma. ""Kama ha ga-atụrụ ime ha achọghị, ọ ka mma ka ha gbochie ya."" ""Makana ọ bụ ihe megidere iwu Naịjirịa nakwa ihe ọghọm ite ime ma ọ bụrụ na ha e gbochighi ya."" Ọ dị ụzọ dị icheiche nwaanyị nwere ike isi gbochie ịtụrụ ime, site n'ọgwụ ọṅụṅụ, nke ọgbụgba na nke a na-etinye n'ime ahụ Dọkịta Akinde gara n'ihu kwuo na ọnọdụ akụnaụba ugbua dị ezigbo ọjọọ na onye ọbụla mụrụ nwa ọ na-achọghị na-etinyekwuru n'ezinaụlọ ya nsogbu. O ruola izuụka atọ gọọmentị etiti nakwa nke steetị dị icheiche machiri ngagharị ndị mmadụ maka ọrịa coronavirus." 43736954,https://www.bbc.com/igbo/43736954,Ndụ Winnie Madikizela-Mandela,"Ka ndị Saụt Afrịka na-akwanyere Winnie Madikizela-Mandela busoro ịkpa oke agbụrụ agha ka ọ nwụrụ n'afọ 81, BBC na-egosi ihe mere na ndụ ya.","Afọ 1936 A mụrụ nwada Madikizela-Mandela na Bizana dị na Transkei nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Cape. N'afọ 1957 Nwata nwaanyị ahụ na-arụ ọrụ obodo zutere Nelson Mandela bụ onye ọkaiwu nakwa onye a ma ama na-ekwusa okwu megide ịkpa oke agbụrụ. Ha mechara lụọ n'afọ so ya. N'afọ 1964 A tụrụ di ya Mandela nga mkpụrụ ọka. Nwada Madikizela-Mandela bidoro mgbasaozi ka a tọghapụ ya nke mere o ji bụrụ onye a ma ama na-emegide ọke agbụrụ. N'afọ 1969 A tụrụ ya mkpọrọ ebe ọ nọrọ mkpụrụ ụbọchị 491 n'ebe onweghi onye na-agwa ya okwu ọbụla. N'afọ 1977 A chụpụrụ nwada Madikizela-Mandela ga Brandfort, obere obodo dị na ngalaba Free Steeti ebe ọ nọrọ ihe rụrụ afọ iri. N'afọ 1986 Nwada Madikizela-Mandela nyere mgbasaozi bọliri uzu nke o jiri kwado ""mgbaolu"", o tinyere taya ụgbọala n'olu ndị e chere na ha na ndị na-achị oge ahụ na-arụkọ wee gbaa ha ọkụ na ndụ. ""Anyị niile ga-eso n'aka n'aka jiri mkpaọkụ anyị na mgbaolu anyị tọpụ obodo anyị n'agbụ,"" ya ka o kwuru. N'afọ 1990 A tọghepụrụ di ya Mandela n'ụlọ mkpọrọ ka afọ 27 gasịrị. Nwada Madikizela-Mandela nọ n'ọnụụzọ ịnabata ya. N'afọ 1991 Ikpe mara ya maka ntọri na mmegbu nwata dị afọ 14 bụ Stompie Sepei. Ndị nche ya jidere Moeketsi n'afọ 1989 nke e mechara chọta ozu ya, mana nwada Madikizela-Mandela kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla, kpe mara ya, a tụọ ya nga afọ isii nke e mechara wetuo ya ọ kwụọ ụgwọ. N'afọ 1993 A họpụtara ya dịka onyeisi ụmụnwaanyị otu pati African National Congress. E mechara hopụtagharịa ya n'afọ 1997. N'afọ 1994 E wepụtara ya dịka osote mịnịsịta na-ahụ maka nka na ụzụ na omenaala n'okpuru gọmenti di ya Mandela. A chụrụ ya ka ebubo mpụ gbasara ya pụatara. N'afọ 1996 Ka afọ 38 ha lụrụ dị na nwunye gasịrị, ha abụọ kewara. N'afọ 2003 E kpere ya ikpe gbasara ohi na mmerụaka metutara ego n'ụlọakụ mana e mechara tụgharịa ikpe ahụ ebe ọ natasịrị ntaramahụhụ afọ atọ n'ọnwa isii nke e wepụrụ. N'afọ 2007 E họpụtagharịrị ya gaa ụlọ omee iwu, ọ gara n'ihu bụrụ onye a ma ama n'etiti ndị ogbenye, ndị isii ojii na mba Sawụtụ Afịrịka na ndị ntọrọbịa. Afọ 2018 Dịka ya na ọrịa lụsịrị ọgụ ọtụtụ oge, Winnie Madikizela-Mandela nwụrụ n'udo A mụrụ nwada Madikizela-Mandela na Bizana dị na Transkei nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Cape. Nwata nwaanyị ahụ na-arụ ọrụ obodo zutere Nelson Mandela bụ onye ọkaiwu nakwa onye a ma ama na-ekwusa okwu megide ịkpa oke agbụrụ. Ha mechara lụọ n'afọ so ya. A tụrụ di ya Mandela nga mkpụrụ ọka. Nwada Madikizela-Mandela bidoro mgbasaozi ka a tọghapụ ya nke mere o ji bụrụ onye a ma ama na-emegide ọke agbụrụ. A tụrụ ya mkpọrọ ebe ọ nọrọ mkpụrụ ụbọchị 491 n'ebe onweghi onye na-agwa ya okwu ọbụla. A chụpụrụ nwada Madikizela-Mandela ga Brandfort, obere obodo dị na ngalaba Free Steeti ebe ọ nọrọ ihe rụrụ afọ iri. Nwada Madikizela-Mandela nyere mgbasaozi bọliri uzu nke o jiri kwado ""mgbaolu"", o tinyere taya ụgbọala n'olu ndị e chere na ha na ndị na-achị oge ahụ na-arụkọ wee gbaa ha ọkụ na ndụ. ""Anyị niile ga-eso n'aka n'aka jiri mkpaọkụ anyị na mgbaolu anyị tọpụ obodo anyị n'agbụ,"" ya ka o kwuru. A tọghepụrụ di ya Mandela n'ụlọ mkpọrọ ka afọ 27 gasịrị. Nwada Madikizela-Mandela nọ n'ọnụụzọ ịnabata ya. Ikpe mara ya maka ntọri na mmegbu nwata dị afọ 14 bụ Stompie Sepei. Ndị nche ya jidere Moeketsi n'afọ 1989 nke e mechara chọta ozu ya, mana nwada Madikizela-Mandela kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla, kpe mara ya, a tụọ ya nga afọ isii nke e mechara wetuo ya ọ kwụọ ụgwọ. A họpụtara ya dịka onyeisi ụmụnwaanyị otu pati African National Congress. E mechara hopụtagharịa ya n'afọ 1997. E wepụtara ya dịka osote mịnịsịta na-ahụ maka nka na ụzụ na omenaala n'okpuru gọmenti di ya Mandela. A chụrụ ya ka ebubo mpụ gbasara ya pụatara. Ka afọ 38 ha lụrụ dị na nwunye gasịrị, ha abụọ kewara. E kpere ya ikpe gbasara ohi na mmerụaka metutara ego n'ụlọakụ mana e mechara tụgharịa ikpe ahụ ebe ọ natasịrị ntaramahụhụ afọ atọ n'ọnwa isii nke e wepụrụ. E họpụtagharịrị ya gaa ụlọ omee iwu, ọ gara n'ihu bụrụ onye a ma ama n'etiti ndị ogbenye, ndị isii ojii na mba Sawụtụ Afịrịka na ndị ntọrọbịa. Dịka ya na ọrịa lụsịrị ọgụ ọtụtụ oge, Winnie Madikizela-Mandela nwụrụ n'udo" egwuregwu-42991603,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-42991603,Arsene Wenger ekwuola na ndị egwuregwu England dị aghụghọ,Arsene Wenger bụ onye nchịkọta otu Arsenal ekwuola na ndị egwuregwu bọọlụ si England nwere ike ịbụ 'nnaukwu' n'ịghọ aghụghọ.,"Arsene Wenger achịala otu Arsenal kemgbe afọ 1996 Enyere Dele Alli na-agbara Tottenham bọọlụ, akwụkwọ edo edo maka ịghọ aghụghọ ịma afọ n'ala ka ha na Liverpool sọrọ mpi n'ụbọchị Sụnde gara aga. Virgil van Dijk na-agbara Liverpool bọọlụ bokwara onye otu Alli bụ Harry Kane ebubo ịma afọ n'ala ka ha ji ya nweta penaliti. Wenger kwuru sị: ""Echetara m na-enwere ụfọdụ ọmụmatụ oge ndị egwuregwu si esi bata mere ya, mana ndị egwuregwu si England amụtala yabụ ihe ọsịsọ nke pụtara na ha nwere ike ịbụ nnaukwu ugbua."" Na Nọvemba, Wenger kwuru sị na Raheem Sterling ""ma etu esi ama afọ n'ala ọfụma"" ka Manchester City merichara Arsenal 3-1. Ihe Wenger kwuru Wenger, onye ndị otu ya ga-eso Tottenham asọ mpi na Premier League nke Satọde na Wembley, kwuru sị: ""Anaghị m agwa ndị otu egwuregwu m ka ha ghọọ aghụghọ imado afọ n'ala ma ọlị. Anyị ga-agba mbọ hụ na anyị wepụrụ ụdị aghụghọ a n'egwuregwu a. ""Oge ụfọdụ ndị egwuregwu na-agbagha iwu etinyere. Kedụ ebe ị ga-erunwu? Nke ahụ dị n'aka ndị referii."" Na Tọọsde, onye nchịkọta Tottenham bụ Mauricio Pochettino kwuru sị na ịma afọ n'ala bụ ""obere okwu"" na bọọlụ, na ịghọgbu onye gị na ya so asọ mpi sozi n'egwuregwu bọọlụ. N'afọ a, ndị Football Association (FA) wepụtara iwu ọhụrụ nke ga-amachi onye ọbụla ịma afọ n'ala. Ndị kọmitii ewepụtara ga-etinye anya n'aghụghọ ndị egwuregwu, ebe ha ga-atule ihe nkiri ụbọchị Mọnde ọbụla. Onye egwuregwu ọbụla achọtara ihe n'aka ya ga-ala ezumiike. Ndị iwu a metụtara N'Oktoba, Shaun Miller na-agbara Carlisle United bọọlụ bụ onye mbụ amachiri ịsọ mpi bọọlụ ugboro abụọ. Oumar Niasse n'agbara Everton bọọlụ bụ onye egwuregwu Premier League mbụ achụlara ezumiike -maka asọ mpi bọọlụ ugboro abụọ- na Nọvemba. A chụlara Niasse dị afọ iri abụọ na asaa maka ihe o mere ka ha na ndị otu Crystal Palace gbara 2-2. E nyere ha penaliti ka ha kpebiri na Scott Dann gbaturu ya. Leighton Baines gbakpuru penaliti na goolu ebe Niasse mechara nye goolu mere ka Everton nwete otu pọintị. Na afọ 2012, Michael Owen bụ onye gbabuuru England bọọlụ tara ""mmetụta ndị egwuregwu bọọlụ si South America, Spain and Italy"" ụta maka aghụghọ ịma afọ n'ala dị n'ime egwuregwu bọọlụ England." 42787749,https://www.bbc.com/igbo/42787749,Trump na-asị na mmepe gọọmenti Amerịka bụ ihe mmeri ndị Republican,Ụlọ nzụkọ ome iwu US ekwekọrịtala maka itinye aka n'akwụkwọ ka ọrụ malite ọzọ na mba ahụ.,"Donald Trump na-ekwu okwu ike gbasara ndi mbịabịa Cheta na ndị Democrat na ndị Republican sere okwu maka itnye aka na ya bu akwụkwọ maka ha ekwekọrịtaghị na ihe gbasara nkpata na mmefu akụ bụ bọjet. Ndị otu Demokrat kwuru na ndị Republicans kwetara na ha ga-eme nkparịta ụka maka onọdụ ndị mbiambia bị n'ala US. Ha ga-elebaanya n'iwu nke a na-akpọ Deferred Action for Childhood Arrivals (DACA) n'olu bekee bụ iwu na-agba mgbọ hụ na ndị umuaka ndị mbiabia nwere ike ị bị na US. Trump na-atụrụ ndị ekwekọrịtara na mmeri ya aka. End of Twitter post, 1 Mana ugbua, ọchịchị Trump akabiela iwu ahụ. Nke a pụtara na iwu nke a ga-akwụsi n'ụbọchị ise na ọnwa nke maachị. Onye na nọchịte anya ndị Demokrat n'ulọ omeiwu bụ Steny Hoyer arịọla ndị otu ibe ya ka ha lebaa anya na ya bụ okwu. Maka akụkọ gbasara mmechi Amerika, gụọ:" afirika-45322741,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45322741,Theresa May: Kedu ihe Igbo chọrọ n'aka Teri?,Onyeisiala mba Briten bụ Theresa May atụọla na Abuja taa dịka ọ ga-ebido nleta abalị abụọ ya na Naịjirịa.,"""Ihe anyị chọrọ ka Theresa May mere anyị"" Ụgbọelu bụ ya daturu na ọdọụgbọelụ nke Nnamdi Azikiwe taa tupu ọ malite ị ga Aso Rock. Ọgbọ ya bụ Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nọ n'ebe anabatara ya n'isi ụlọọrụ Aso Rock taa na nkwadobe nzụkọ imeụlọ ha ga-enwe. Mgbe ọ gara na mba Saụt Afrika, Theresa May kwere nkwa na Briten ga etinye ihe ruru pound ijeri anọ n'ọrụ na mba Afrika nke ga-enyere ha aka ịnye ndị ntorobịa ọrụ. Ụfọdụ n'ekwu na ""ihe Naịjirịa chọrọ abụghị ego mmachiakpa kama na ha chọrọ ka Briten nye aka ime ka obodo a kwụsịike"". Njem a so na ihe May hibere iji mee ka mmekọ Briten na mba Afrịka siwanye ike dịka ha na-achọ ịkwụrụ onwe ha mgbe ha hapụrụ Europian Union na 2019. Ụfọdụ na-ekwukwa na ọdịghị mbe pụrụ inye ibe ya aka nye ndị be ha ọrụ kama Briten nwere ike inye aka ka ọchịchị onye kwuo ụche ya kwuru chim na Naịjirịa. Mana Theresa May na-ekwusi ike na n'ezie ego mmachịakpa mba na-enye mba na-enye aka nke ukwuu. Leeka sụpirịsụpịrị ya ebe . Ochie dike na ihe gbasara azụmahịa bụ Odilim Basil Enwegbara na-ekwu na ekwesiri ịkapị ọnụ ihe Briten chọrọ iji ya bụ ego mee na Naịjirịa. Ma ọbụghị ya, ""mara na ya bụ ego furu ọkpọrọ"". Ọ sịkwa na njem a ga-enyekwa aka ịme ka gọọmenti mba Afrika ""meghe ụzọ ha maka azụm ahịa mba ụwa mana ha ga agbambọ hụ na etinye ndị ma maka teknụzụ na ọrụ ka ọwere dị nfe ịme ka mmụta tecknụzụ nke sị na mba fere mba dị ire"". N'ezia, azụmahịa mba Briten na Naịjịrịa malitere ịkpọ imi n'ala kemgbe nke bụ na ọ darụọla ijeri atọ na ụma asaa. Theresa May na Muhammadu Buhari Ya mere ha jị achọ ụzọ abụla ụzọ aga esi mee ka ya bụ azụmahịa kporokwa ọkụ ọzọ. ""Ihe anyị chọrọ ka Theresa May mere anyị"" Ihe osise gosiri ka UK na Naịjirịa sị zụkọ ahịa n'afọ 2017 Onye ọzọ BBC pidgin gbara ajụjụ ọnụ bụ Bongo Adi sị na ihe Briten ga-eme bụ inyere Naịjịrịa aka napụtacha ego ha ezupuru na mba ọzọ. Bongo sịkwa na Briten na Naịjịrịa kwesiri ịtụkọ isi ọnụ ịmara ka a ga-esi kwọwa onye ụkwụ wara ka iji were kwe ọjịje na okwu gbasara mpụ na ngarị bụ nke na-achọ ịta isi obodo a. Ọ sịkwa na-agbanyeghị na China ekwunyela na Naịjirịa n'ihe gbasara ọrụ mmepe obodo mana na ọnweghị ihe ọmere Briten ịgbakwa mbọ nke ha. Ka a na-ekwu ka a na-ekwu, onye nọchite anya Briten na Naịjirịa ekwuola na Briten eweghachitala ego dị nde pound iri na asaa (£70,000,000) ezurupuru ezupu. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49796448,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49796448,Lizzy Anjorin vs Toyin Abraham: 'Agaghị m etinye ọnụ n'okwu mmadụ abụọ a',Esemokwu dị n'etiti Toyin Abraham na Lizzy Anjorin bụ chi na-efo ọ na-abawanye.,"Nke mere ọhụrụ bụ akụkọ na-ewu na otu nwada Igbo ebola ya bụ nsogbu n'isi nwaada Igbo ọzọ na-eme ihe nkiri aha ya bụ Nkechi Sunday Blessing. Mana mgbe BBC Igbo kpọrọ Nkechi Blessing, ọ gwara anyị hoo haa na onweghị ihe gbasara ya n'esemokwu ahụ. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ya na Toyin Abraham bụ ezigbo ọyị mana Toyin dọrọ onye ọbụla nọ n'akụkụ ya aka na nti ka ha hara itinye ọnụ n'okwu dịrị ya na Lizzy Anjorin. Blessing kwuru na ọ bụ makana ọ gbara nkịtị kamgbe esemokwu a bidoro kpatara ndị mmadụ ji na-ebo ya na o butere ya bụ okwu. Etu esemokwu Lizzy Anjorin na Toyin Abraham si malite Ndị tinyegoro ọnụ n'okwu a Otu dịka ""Theatre Arts and Motion Pictures Association of Nigeria""(TAMPAN) gosiri iwe ha gbasara esemokwu mmadụ abụọ a na-ese. Ndị na-eme ihe nkiri na Yoruba a ma ama dịka Yinka Quadri , Bolaji Amusan nakwa di Toyin bụ Kola Ajeyemi arịọla ha ka ha tinye mma ha n'ọbọ. Esemokwu dị n'etiti ndị ihe nkiri abụghị ihe ọhụrụ , ọ na-emekarị n'etiti ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasi gị Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-45619761,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45619761,Ọnwụ akpọrọkwuola nwunye Ras Kimono ka ọnwa atọ gachara,Efemena Okedi nwụrụ na-erughi otu ọnwa e lichara di ya bụ Ras Kimono.,"Akụkọ kwuru na Okedi bụ nwunye nke atọ Kimono nke ezigbo aha ya bụ Oseloke Augustine Onwubuya, nwụrụ n'isi ụtụtụ Septemba 23, 2018, n'ụlọ ya dị na Magodo, Isheri, na Legọs. N'agbanyeghi na amabeghi ihe butere ọnwụ ya, akụkọ kwuru na o kwuputara na e nwere etu ahụ si n'eme ya tupu ọ nwụọ ka awa ole na ole gachara. Oge ha abụọ dị ndụ, ha mụrụ otu nwa nwaanyị n'afọ 2013. N'ihe ikpeazụ o dere n'elu soshal midia, Okedi chetara ọnwụ di ya ka izu abụọ gafere, ma kpọọ ya 'ọdụm'. Okedi bụkwa onye na-achịkọta ndị otu egwu Kimono, ma bụrụkwa onye na-elekọta ihe gbasara ọrụ ya. Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọnwụ ya Sososoberekon bụ onye ama ama gbasara ilekọta ndị na-eti egwu, kwuru na ọ bụ ihe mwute na Okedi anwụọla. Otiegwu Sammie Okposo kwuru na ya na ya kpara nkata n'elu Whatsapp tupu ọ nụ na ọ nwụọla n'ụtụtụ a. Ome ihe nkiri bụ Ejiro Okurame dere ụbọchị Kimono nwụrụ ma dee ụbọchị ezigbo enyi ya bụ Okedi nwụrụ, ma kwuo na ọ ga-aga ezumike maka ikpe nnukwu ekpere. Cheta na e liri Ras Kimono n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọst, 2018. Pretty Okafor bụ onyeisi otu ndị oti egwu akpọrọ ""Performing Musicians Association of Nigeria"" na Bekee gwara onye ntaakụkọ anyị na ọnwụ Ras Kimono na-eme ya ka nrọ. Ọnwụ Ras Kimono na-eme m ka nrọ" 48698674,https://www.bbc.com/igbo/48698674,Festus Adedayo: Ihe mere ndị na-akwado Buhari ji chọọ ka a chụọ nwa amadi a n'ọrụ,Ọtụtụ na-akwado ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC akpọọla oku ka a chụtuo Festus Adedayo n'ọrụ.,"Festus Adedayo Adedayọ bụ onye ntaakụkọ 'Nigerian Tribune' bụrụkwa onye a ma ama na-akatọ ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buharị. N'ụbọchị Tuuzdee, onyeisi ụlọomeiwu ukwu bu Ahmad Lawan họọrọ Adedayọ dịka ọnụ ga na-ekwuru ya. Nke a atọghị ndị otu APC ọchị ma ncha n'ihi na ha sịrị na o kwesịghị ekwesị na ọ ga aghọrọ mkpụrụ ebe ọ na-akụghị. Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Ahmed Lawan Ọtụtụ n'ime ha kwuru na Adedayo bụ ọnye iro APC ya mere o ji jọgbuo onwe ya na ọ ga esoro ha na-emekọ ihe. Ha malitere kesawa ihe ọjọọ niile Adedayọ dere gbasara Buhari nakwa APC n'oge gara aga. Lee ihe ndi ha dere: @cbngov_akin1 kwuru na nhọrọ a họọrọ Adedayo bu ihe mkparị nye ha bụ ndị otu APC. @EmerieUduchukwu kwuru hoohaa na Adedayo kpọrọ APC asị nke na onweghi ihe ọma ga-esi n'aka ya apụta. @tuwo_mai kwukwara na Adedayo ga na-agbara ndị iro APC ama. Mana @CitizensUpdate kwuru na aha Adedayo adịkwaghị na akwụkwọ nke gosipụtara ndị Lawan were n'ọrụ. Akụkọ ga-amasị gị:" 45022718,https://www.bbc.com/igbo/45022718,Bukola Saraki agbajọọla ndị APC,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki agbajọọla ndị APC.,"Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Saraki kwuru nke a n'akara Twitter ya na nkeji ole na ole gara aga. End of Twitter post, 1 Saraki ekwughị pati ebe ọ na-aba mana o kwuru na ya apụọla. Mana gọọmenti etiti ekwuola na ha amaghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti apụọla na pati APC. Onye nkwuchiteọnụ gọọmenti etiti bụkwa mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị n'aka bụ Lai Mohammed gwara BBC na a gwabeghi ha na Saraki apụọla na pati APC. Onye nkwuchiteọnụ APC na Legos bụ Joe Igbokwe kwuru na ọ bụ ndị mgba okpuru na-apụ na pati ahụ. N'okwu ya, ""APC abụghị PDP, Buhari abụghị Jonathan, ọpụpụ ha enweghi ihe ọ ga-eme APC."" Mana n'elu soshal media, ụmụ Naịjirịa na-etu o si emetụta ha. Tell the Mayor kwuru na ma ụmụ Naịjirịa ekwesiri ibe akwa ka ọ bụ ịchị ọchị gbasara ya, na ọpụpụ ya abụghị maka ụkpụrụ ọma ọ chọrọ igosi maọbụ maka ọganihu ndị mmadụ kama ọ bụ nhazi ọ na-eme maka onwe ya. Abraham Itebu kwuru na o si PDP gaa APC na 2014 sikwa APC gaa PDP na 2018 na-ekwu na ha ji ụmụ Naịjirịa eti epele nakwa azụmahịa onwe ha. Olusanjo Ewulomi kwuru na o kwesiri ị hapụ oche ya maka na pati na-akarịghị n'ọnụọgụgụ enweghi ike ịnwe oche ahụ. Onye omeiwu ibe ya bụ Ben Murray Bruce kwuru na ya ji aṅụrị anabata Saraki na pati ha bụ PDP mana Saraka ekwughikwa na ya na-aga na PDP. Otu pati PDP dekwara n'akara twitter na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki na-alọghachi na PDP. Cheta n'izu gara aga, ndị ụlọomeiwu mmadụ 15 nọbu pati APC wufere pati PDP ebe ndị nnọchiteanya mmadụ 38 bụbu ndị APC wufekwara PDP na pati ndị ọzọ. Akụkọ ga amasị gị:" afirika-43794242,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43794242,Emela emume icheta 'Things Fall Apart' ka ọ gbara afọ 60,Akwụkwọ a Chinua Achebe dere bụ akwụkwọ nyochara omenala ndị Igbo mgbe ha nọ n'ọchịchị ndị ọcha.,"Akwụkwọ a butere Achebe ntuliugo dị icheiche E bipụtara ya mbụ n'afọ 1958 ma rekwa ihe karịrị nde iri n'abụọ n'ụwa niile. E degharị kwara ya n'asụsụ karịrị iri ise nke mba uwa niile n'asụ. I ji kwanyere ya ugwu maka ncheta ụbọchị ebipụtere ya, ndị na-eme ihe onyonyo na ndị edemede gbakọrọ gụọ akwụkwọ a n'ụlọ emụme Southbank na London Ben Okri bụ onye odee akwụkwọ nwere ntụliugo dị icheiche so kwa n'ọgụgụ a Ọ gụrụ isi mbido akwụkwọ ahụ ebe a: Ben Okri na-agụ isi nke mbụ na Things Fall Apart Chibundu Ọnụzọ bụ onye odee akwụkwọ ọzọ nọ ebe ahụ sị na akwụkwọ a bụ akwụkwọ pụrụiche Ọ sị ""I wenyia akwụkwọ a, ọ ga ahịa gị ahụ ị tọgbọ ya tupu ị gụcha ya"" Ndị gara ebe e mere emume a na-egosi aṅụrị ha na soshal midia:" afirika-48116868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48116868,Caster Semenya: Ụlọikpe akagbuola mkpesa ya megide iwu 'Testosterone',Otu ndọrọndọrọ ANC nke nọ n'ọchịchị akatọọla mkpebi otu ụlọikpe nyere Caster Semenya gbasara okwu 'Testosterone'.,"N'ime akwụkwọ ozi ha biiputere nke BBC hụrụ anya ha kwuru na ya bụ mkpebi bụ ihe mwute. ""Mkpa mkpa IAAF kpara gosiri na ha ebughi ndịnotu ndị egwuregwu Sawut Afrịka n'uche"" Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia @greenrascal_ kwuru na ọ pụtara na ọ ga-abịa soro ụmụnwoke na-ama aka? @thamzozo11 kwuru na ihe a bụ ikpa oke n'etiti nwoke na nwaanyị. @ziakpornho kwuru ka ahapụ Samenya ka o mee ihe gụrụ ya agụụ maka na ya bụ 'Testosterone' esighị ya n'aka. Ha gwakwara ihu kwuo na ha na ndị mba ahụ ruru nde ole na ole kwụ Semenya n'azụ. Otu a a kpọrọ ""Southeast For President 2023"" gụnyere ụmụ Igbo si n'ebe dị iche iche wụchie n'Enugwu bụ ebe eduru ha n'iyi ọrụ. Ụmụ Igbo ọnụ na-eru n'okwu ejikọtala aka hiwe otu ọtawaike ọrụ ya bụ ịhụ na Igbo nwetere ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Otu a a kpọrọ ""Southeast For President 2023"" gụnyere ụmụ Igbo si n'ebe dị iche iche wụchie n'Enugwu bụ ebe eduru ha n'iyi ọrụ. Onyeisi a bụ Rev. Okechukwu Obiora Kwuru na ihe mere eji hiwe otu a bụ iji bido n'oge kwado ndị Igbo maka iwere ọchịchị n'afọ 2023. Rev. Obiora kọwara na ndị Igbo agaghị ekwezi ka a na-eme ha ka ndị mbịarambịa n'ala ha bụ Naịjirịa. O kwuru na ibido n'oge kwado nke ọma ga-enye ndị Igbo mmeri. Rev. Okechukwu Obiora bụ onyeisi otu ""Southeast For President 2013"" Ọ gara n'ihu kwee nkwa na otu a abụghị maka ịchọ ego kama na ọ bụ maka ọdịmma ụmụ Igbo. Onye nchikọba otu ahụ na mba Amerịka bụ nwada Nkoli rịọrọ ụmụ Igbo ka ha hụrịta onwe ha n'anya ma saa anya na mmiri họpụta onye ga achị Naijiria n'afọ 2023. Onyeisi oche na emume idu n'iyi ọrụ otu ""Southeast For President 2023"" bụ Grant Ehiobuche kwuru na oge eruola mgbe ndị Igbo ga-eji atọpụ agbụ ekere ha. Ehiobuche rịọrọ ndị Igbo arịrịọ ka ha ghara ịhapụ onye nke ha gaa na-akwado ndị ọzọ. Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Chinedu Nebo kwuru na ọ bụ ụmụ Igbo ga-ejị aka ha jụ ekwensu na ọrụ ya niile, ""nke na onye ọbụla agwara ka eree nwanne ya ọsi mba."" Ndị ọzọ nyekwara ndụmaọdụ na emume a gụnyere ụmụ Igbo sị Anambra, Imo, Ebonyi, Abia nakwa Enugwu. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52801220,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52801220,Children's Day 2020: Etu nke afọ a ga-esi adị iche na ndị ọzọ a na-emebu,"Emume ụbọchị ncheta ụmụaka nke afọ 2020 a gaara eji otu ụkwụ kara ibe ya, mana ọrịa coronavirus emenyụọla ya ka ọkụ.","Ụbọchị Mee 27 bụ ụbọchị e kewapụtara maka ime emume a ga-abịa, gafee n'afọ a, mana enweghi onye ga-atụpụrụ ya ọnụ n'ihi ọrịa coronavirus na-anyụ ụwa ịkpakwụ ugbua. Ebe nke afọ ndị gara aga na-akpụ ọkụ n'ọnụ na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa, ọtụtụ ụmụaka agaghị echeta nke afọ a n'ihi na emume ndị e ji echeta ya agaghị eme n'ihi mmachi ngagharị na nnọkọ gọọmentị tinyere iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus. Ụbọchị Ncheta Ụmụaka nke Mee 27 abụghị nke mbaụwa Ị ma na ọ bụ naanị na Naịjiria ka a na-eme ncheta ụmụaka n'ụbọchị a? Mana ụbọchị ngalaba United Nations wepụtara maka ncheta ụmụaka bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba. N'ụbọchị ncheta ụmụaka, gọọmentị mere ya ka ọ bụrụ ụbọchị ha ga-eji nweta onwe ha, ghara ịga akwụkwọ. Ihe a na-emekarị n'ụbọchị ahụ N'afọ ndị gara aga, egwuregwu na mmemme gbasara ụmụaka na-eju ụbọchị ahụ; nke gụnyere ime nke Bekee kpọrọ ""march past"", nakwa nke a kpọrọ ""party"". Ụmụaka na-atụkarị anya ihe ndị a: 1) ""March past"": Nke a bụ mgbe ụmụakwụkwọ si n'ụlọakwụkwọ dị iche iche na-agbakọta n'otu ọgbọegwuregwu (stadium) dị na steeti ahụ, ebe ha ga-anọ mee ""marching"" nke ụfọdụ ndị si n'oche ọchịchị gọọmentị steeti ahụ na-abịa elele. Ụmụaka na-akwado ọfụma ma kpaa agwa ọfụma n'ihi na a na-eme ka ha ghọta na ""onye dị mkpa nọ n'etiti ha"". 2) Uwe ọhụrụ: N'ihi ọgbakọ a na-eme n'ọgbọegwuregwu, a na-akwara ụfọdụ ụmụaka uwe ọhụrụ (ọkachasị ndị nke ga-eso mee ""march past"") a na-azụrụ ndị ọzọ uwe na akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ ka ha yiri soro ụmụaka ibe ha dịkwa ka e so n'ihe a na-eme. 3) Ime enyi ọhụrụ: Ọtụtụ ụmụaka na-eji ụbọchị ahụ emeta enyi ọhụrụ (mgbe ha gbakọrọ n'ọgbọegwuregwu ma zute ụmụaka si ebe dị iche iche bịa), ebe ndị ọzọ na-eji ụbọchị ahụ ezute ndị enyi ha ndị ha ahụbeghi anya kemgbe. 4) Ụbọchị oringo: Nye ọtụtụ ụmụaka, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ha na-eji egwu egwu, nweta onwe ha nakwa nweta ego mmachi akpa n'aka nne na nna ha. A na-enyekarị ha ohere ime ihe masịrị ha, mana ha ga-agba mbọ hụ na ha lọtara ụlọ na-enweghi ihe ọbụla mere ha. Etu nke afọ 2020 ga-esi dị iche: Ọrịa coronavirus na mmachi so ya emeela ka ọtụtụ ihe gbanwee; ihe gụnyere ndị mmadụ ịgbakọ, mmechi ụlọakwụkwọ, ime njem, ịga ebe ndị mmadụ nwereike ịnọ nweta onwe ya. Ụmụaka sere ma na-egosi ihe na-agụụ ha agụụ ime kemgbe e tinyere mmachi ngagharị n'ihi coronavirus Etu o si metụta ụmụaka gụnyere: 1)Ha tọrọ n'ụlọ: Mmachi ngagharị ga-eme ka ụmụaka nọrọ n'ụlọ na-arọ nrọ mgbe ọzọ ha ga-apụnwu ezi gaa zute ndị enyi ha ma gwuru egwu. Mana kama ha na ndị enyi ga-ezute, ha na ezinaụlọ ha ga-anọ n'ụlọ hụ isi ya. Ha na-akwasa, ha a na-edozi ihe ha kwasara (ọ na-atọkwanụ ọchị?) 2) Ha agaghị ahụ ego anya: N'ọnọdụ ụwa nọ ugbua, ha mee elu mee ala, shị shị ọtụtụ n'ime ha agaghị ahụ. Otu ihe butere nke a bụ na enweghi ebe ha na-aga ga-eme ka e nye ha ego mmachi akpa. Ọzọ bụ na ọrịa a na-efegharị butere ọchụchụ ụfọdụ ndị nne na nna, ebe ụfọdụ apụbeghi ezi gaa chụọ nta ego etu ha si emebu; n'ihi mmechi obodo. 3) Ọrụ chere ha: Kama ịbụ ụbọchị dị mkpa e wepụtara ka ha ji nweta onwe ha, ụfọdụ ga-ahụ na ha agbatanwughi ozi na-eche ha n'ụlọ n'ọsọ. Ebe ha gaara eji ""eso m eme marching n'ụlọakwụkwọ anyị"" gbanarị ozi ha kwesịrị ịga na ọrụ ha kwesịrị ịrụ ụbọchị ahụ n'afọ ndị gara aga, enweghi ebe ha ji azụ aga na nke afọ a n'ihi ihe na-eme n'ụwa. Coronavirus mere ka ọ bụrụ na enweghi etu ị ga-esi gbanarị ọrụ dịrị gị n'ụlọ. E nwere nke anyị chefuru ịrụtụ aka? Lee ihe nkiri na-egosi ụmụaka na-ekwuputa ihe kachasị ha mkpa na Naịjirịa: Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ụgbụa Ihe ndị ama ama na-agwa ụmụaka na May 27 nke afọ 2020 Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari gwara kelere ụmụaka, ma rịọ ha kpachapụ anya n'oge coronavirus a, ma na-amụsi ihe ọmụmụ intaneti ha ọfụma. Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ji ohere a gwa nne na nna maka ịnye ụmụaka ezi nlekọta n'oge coronavirus a. Onye enyemaka onyeisiala Buhari Muhammadu maka soshal midia bụ Bashir Ahmad ji photo ndị a wee kelee ụmụaka. Ngalaba na-ahụ maka igbochi ọrịa na-efe efe na Naịjirịa akpọrọ NCDC n'ịchafụ ekelela ụmụaka ma na-arịọ ka onye ọbụla gba mbọ lekọta ha ọfụma n'oge covid 19. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50415967,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50415967,Fire in Yaba: E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba,Akụkọ na-eru anyị ugbua bụ na ndị ọrụ gbatagbata emenyụọla ọkụ na-agba n'otu ọdọahịa dị n'ahịa Yaba dị na Legọs n'ehihie Tọọzde.,"Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọkụ ahụ bidoro n'ọnụ ụlọ otu onye, mana etu ọ dị, onweghị onye nwụrụ. Ha kwuru na ọ bụ ngwa igwe ọkụ a kwụnyere n'ọkụ latrik nwuru ọkụ ka e wetara ọkụ. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara mana ha ahụb=ghị ohere gbanyụ ọkụ ahụ ngwangwa n'ihi igwe mmadụ gbakọtara ebe ahụ. Mana ha mechara gbanyụọ ọkụ ahụ. Ụlọọrụ gbatagbata Legọs a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ kwuru na o nweghị onye nwuru n'ọkụ ọgbụgba, naanị mmadụ abụọ merụrụ. Ha gbara ama n'ọkụ ahụ kpara ike nke mere ụlọ ahụ jiri gbawacha aja ụlọ ahụ mee ka ọ daa. Burna Boy ga-arịọ anyị mgbaghara - ndị ntorobịa South Afrịca Burna Boy Ọtụtụ ndị ntoroọbịa mba Saụt Afrịka ekwuola na Burna Boy ga-arịọ ha mgbaghara tupu ọ bata obodo ha ọzọ. Nke a bụ maka ihe Burna Boy kwuru n'oge a wakporo ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka. Burna Boy bụ onye otiegwu Naịjirịa aha ya na-ewu ewu n'ụwa niile. N'oge ahụ, o kwuru na ya agaghịzị atụ ụkwụ na Saụt Afrịka ọzọ ruo mgbe gọọmentị mba ahụ ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ụmụ Naịjirịa ebe ahụ. Burna na onye otiegwu Saụt Afrịka aha ya AKA, sere nnukwu okwu n'ihi ya bụ ihe. Ugbua, Burna kwuru na e nwere emume a kpọrọ ya ka ọ bịa kụọ egwu na Saụt Afrịka. O kwuru na ego a ga-akwụ ya n'emume ha agaghị aba n'akpa ya kama ọ ga-agara ụmụ Naijirịa e mebiri ihe ha na mwakpo Xenophobia n'oge gara aga. Mana ndị ntorobịa Saụt Afrịka na-ekwu na soshal midia na Burna ga-arịọrịrị ha mgbaghara tupu ha ekwe ya ịbata obodo ha ọzọ. Ụfọdụ kwuru na ha edegarala gọọmentị akwụkwọ ka Burna Boy ghara ịtụ ụkwụ na be ha. Atọhapụla ọkaikpe ndị ntọrị ji Ọkaikpe Chioma Nwosu-Iheme enwerela onwe ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na Edo steeti bụ Chidi Nwabuzor gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Mana okweghị ekwu etu ọkaikpe ahụ si nwere onwe ya. Cheta na ndị ntọrị nwụchiri Ọkaikpe Nwosu-Iheme na Benin, isi obodo Edo Steeti n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba. Ndị ekperima ahụ gbagburu onye uweojii na-eche ya nche tupu ha akpụrụ ya. Sowore na ndị DSS Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Ndi ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ State Security Service ka na-ekwusị ike na ha agaghị atọhapụ Omoyele Sowore ganye na ndị gbaara ya aka ebe abịa ịkpọrọ ya. Peter Afunanya, onye okwuru ọra ndị DSS kwuru na Femi Falana, bụ onye ọkaiwu Sowore, ma ihe o kwesịrị ime tupu atọhapụ ya, mana ọchọghị ime ya. Bayelsa aghọọla ọgbọ agha Gọvanọ Seriake Dickson gara leta ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ Mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' mere ịchụ nta vootu na Bayelsa Steeti n'ụbọchị Wenezdee. Nke a mere n'obodo Ogbolomabiri nke dị n'okpuru ọchịchị Nembe na steeti ahụ. Ụmụokorọbịa anya na-acha ọkụ bucha egbe dabata n'ama egwuregwu 'King Koko Square' ma chụsasịa ndị mmadụ. Ndị mmadụ ka nọ na-eche onye Douye Diri bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ na pati PDP mgbe ya bụ ọgbọaghara malitere. Onye ọkwọụgbọala nke Radio Bayelsa na otu onye ọzọ bụ ndị mgbọ tụgburu. Ọtụtụ ndị ọzọkwa merụrụ ahụ. Ha nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ. Claire Pierangelo N'otu aka ahụ, mba Amerịka ekwuola na ha ga-ata ndị ọbụla tinyere aka n'ọgbaaghara na Bayelsa Steeti ahụhụ. Onye nnọchiteanya mba ahụ na Naịjirịa bụ Claire Pierangelo kwuru na onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla aka ya dị n'ọgbaaghara agaghị enwe ike ịba Amerịka ọzọ. Pierangelo kwuru na anya Amerịka na-eke ka ọkụ na ya bụ ntuliaka a ga eme n'ụbọchị Satọdee. Akwa mmiri 'Third Mainland' a na-ama jijiji? Ụjọ atụla ụnụ. Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị. Akwa mmiri 'third mainland' siri ike, ọ naghị ada. Nke a sị n'ọnụ gọọmentị etiti gbasara asịrị na-efegharị na akwa mmiri ahụ na-amazi jijiji nke na o nwere ike ịda. Ebola enweela ọgwụ mgbochi Otu ahuike mba ụwa akwadola otu n'ime ọgwụ ndị arụpụtara maka iji gbochie ọrịa ebola. World Health Organisation kwuru na nke a ga-enye aka iji hụ na ọrịa ọjọọ a kwụsịrị ịgbasa n'ọtụtụ mba Afrịka dị icheiche ebe ya bụ ọrịa na-akpa mkpamkpa ugbua. WHO kwuru na a ga-amalite ịgba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n'aafọ 2020. Super Eagles enwetala mmeri Mmeri ka Naịjirịa ji malite asọmpi e ji akwado maka iko mba Afrịka nke afọ 2021 n'ama egwuregwu dị n'Uyo, Akwa Ibom Steeti ụnyaahụ. Benin Repọblik bu ụzọ gbaa aka ahịa mana Victor Osimhen na Samuel Kalu nyetere goolu abụọ Naịjirịa ji wee merie. England na Montenagro Mba England na ndị Montenagro ga-ezute onwe ha taa n'asọmpi nkwado maka egwuregwu Euro 2020. Naanị otu akara ka ọ fọdụrụ ka Ịngland tozuo oke iso na ya bụ egwuregwu. Ndị ọzọ ga-agba bọọlụ n'abalị taa gụnyere: Tọkị na Aịsland, Pọtụgal na Lithuania, Fransị na Mọldova Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??" afirika-51000880,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51000880,Gọvanọ Okezie Ikpeazu akpọghị IPOB otu oyiegwu- Abia State,Gọọmentị Abia steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị nke sị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu kwuru na ya achọghị ndị oyi egwu bụ Ipob na steeti ya bụ asi.,Ọnụ na ekwuchitere gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kwuru na ọnweghị mgbe Ikpeazu jiri kwuo ụdịrị okwu a ma ọ bụ na nzụzọ ma n'ịhu ọha mmadụ. O kwuru sị na dịka ọnụ na ekwuchitere Abia steeti ma sị na enweghị mgbe Gọvanọ Abia steeti jiri kwuo ụdịri okwu a. Ememanka kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ajụrụ ajụ oge emere ntụlịaka bidoro akụkọ ụgha a. O kọwakwara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchi a bị na Legos steeti ma sị kwa na ụche obi ha bụ ibute ọgbaaghara na Abia steeti. Na Benue Steeti Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Benue bụ Shehu Tambaya akpọkuola gọọmetị etiti ka ha hapu ịkpọlata ndị agha na-echekwa ebe dị iche iche na Naijirịa. Tambara kwuru nke a ma sị ọkachasị Benue steeti ebe ndi mmadụ bi na ogige gbata gbata maka nwakpo ndị ọchi ehi na awakpo ha n'ime obodo. N'Ofesi Ọ bụkwa otu Alshabab wakpro ọdọ ahia 'West Gate' were gbuo mmadụ iri isii na asatọ n'afọ 2013 Ndị oyi egwu bụ Al shabaab awakpoola ọgịge ndị agha Kenya na nke mba Amerịka dị na Obodo Lamu na Kenya. Ha mebiri otutu ụgbọelu na ụgbọala tupu ndị agha mba Kenya were chụpụ ya. N'egwuregwu Otutu ndị ọhụrụ ka Liverpool ji gbaa asọmpị a Na FA Cup taa; Ndị otu egwu bọọlu Chelsea achịrila aja nwunye ndị Nottingham forest n'ọnụ dịka ha jị ọkpụ goolu xxx asataghị ma ncha were merie ha na asọmpị FA cup ebe Liverpool ji otu ọkpụ goolu were kpaa ndị otu Everton Eze. Akụkọ ga-amasị gị afirika-56311569,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56311569,Kennedy Nzechukwu bụ onye akpụ n'ọnụ ugbua n'asọmpị UFC 259,Kennedy Nzechukwu kụrụ Carlos Ulberg n'asọmpị 'light heavyweight' UFC 259 iji nwete mbụgo.,"Nke a mere dịka a na-atụ anya na Israel Adesanya ga-echịpịa Jan Blachowicz ọnụ n'ogo nke ha UFC 259 mana nke a emeghị. Nzechukwu alụọla ọgụ UFC ugboro atọ ugbua , nke mbụ bụ ya na Paul Craig onye mba Scotland kwatara ya, nke abụọ bụ ya na Darko Stosic na Newark, New Jersey . Nke a o meriri Carlos Ulberg na Las Vegas bụ ọgụ atọ ya na UFC 259 kamgbe ọnwa iri na asaa o kwụsịrị isonye n'ọgụ UFC maka ahụ o meruru. Mmeri a tinyere oke ọnụ n'ọnụ ụmụ Naịjirịa dịka ha na-ekwu na ọ bụ eziokwu na Israel Adesanya emerighị n'asọmpị UFC 259 n'ogo nke ya na Jan Blachowicz kwatara mana mmeri Nzechukwu na-akasi ha obi ugbua. Ihe ikwesiri ịma maka nwa afọ Igbo ụwa kpụ n'ọnụ ugbua na UFC 259 Nzechukwu bụ nwa Imo steeti dị n'ala Naịjirịa. A mụrụ ya n'ọnwa June 13, n'afọ 1992. Nzechukwu na ndị bee si Naịjirịa gawa nba Amerịka n'afọ 2010 dịka Wikipedia si depụta. Nne ya mechara gaa debanye aha ya n'egwuregwu 'Mixed Martial Arts n'afọ 2015' mgbe ọ nọ na kọleji. O mechara si n'ụlọakwụkwụ kọleji mgbe nne ya bidoro rịawa ọrịa." afirika-46938002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46938002,2019 Elections: Gịnị mere ndị ndọrọndọrọ ji agbahapụ nrụrịta ụka,"Site na nrụrịtaụka nke BBC Igbo hibere ma rue nke ọgbakọ mgbasaozi Naịjirịa bụ BON n'aha ịchafụ hibere maka ọkwa onyeisiala, ndị ndọrọndọrọ agbahapụla ụfọdụ nrụrịtaụka.","N'ime mmadụ anọ nke ndị BBC Igbo kpọrọ oku maka nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti, sọsọ otu onye pụtara. ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC N'otu aka ahụ, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa Atiku Abubakar nke na-azọ ọkwa onyeisiala gbahapụrụ nrụrịtaụka nke BON haziri maka ha na ibe ha. Nrụtịtaụka bụ ohere ndị na-azọ ọchịchị kwesiri ị ji gosi ihe ha bụ n'uche banyere ndị ha na-achọ ịchị nakwa zaa ajụjụ ọbụla ha nwere. Mana kedu ihe mere ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ejighi ekwe egosi ihu ha n'ebe ọ dị mkpa? Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Nicholas Ibekwe akụwala akụoyibo nsugbe gbasara ya bụ owku. Ọ sị na ụfọdụ oge, ndị ndọrọndọrọ akpọghị nrụrịtaụka ihe dị mkpa n'ihi na-onweghi ihe uru ha na-erite na ya. Ihe ọzọ Ibekwe kwuru bụ na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa enweghi akọ na uche ị ghọta ihe omimi dị na ndọrọndọrọ ọchịchị. N'uche ya, nke a ga-eme ka ha ghara iji nrụrịtaụka ọbụla kpọrọ ihe ma mekwaa ka ndị ndọrọndọrọ gbalahụ ya n'ihi ahụghị mmadụ. BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị a gbajoro nrụrịta ụka mana ha asaghị ekwenti ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" mba-uba-44573949,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44573949,Rọshịa 2018: Ihe ise ị maghị maka otu egwu bọọlụ mba Aịsland,Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla ndị bụ ndị Aịsland a jidere mba Ajentina n'ọrụ ha ji gbaa onwe ha onye laba onye laba n'asọmpi Iko Mbaụwa na-eme ugbua.,"Mba ahụ nọ n'otu D ga-agba Naịjirịa taa mana ha kparịrị Ịnglandị gbaa ha ọkpụ goolụ abụọ a satara naanị otu na asọmpi Yuro afọ 2016. Aịsland bụ nwantịtị obodo na-erughi ka otu steeti na Naịjirịa mana ha na-akpa ike dị egwu. Lee ihe 5 ị na-amaghị gbasara mba ahụ na otu egwu bọọlụ ha: 1. Ọnụọgụgụ mba Aịsland niile erughi ọnụọgụgụ ndị nọ n'Enugwu: Mba Aịsland dị naanị mmadụ 334,252 ebe Enugwu dị nde mmadụ 3.2 2. Onye nkuzi ha bụ dọkịnta eze ebe mmadụ asatọ n'ime otu egwu bọọlụ ha bụkwa dọkịnta Kedụ ka dọkịnta eze si enye ọtụtụ mba siri ike n'egwuregwu bọọlụ nsogbu niile a? Ihe a bụ ọgbara Igbo gharị maka na onye nkuzi ha abụghịdị onye nkuzi bọọlụ oge niile. Hiemir Hallgrimsson na-arụ dxịka dọkịnta eze ma na-akụzikwara ha egwu bọọlụ. Ọ natara ọrụ ya n'aka Lars Lagerback bụ onye Sweden bụkwara onye nkuzi otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles. Ndị nọkwa n'otu egwu bọọlụ ha na-arụkwa ọrụ ọzọ gụnyere ịgba bọọlụ. 3. Onye na-echere ha goolu na-emebu ihe onyonyo Ụdị ihuigwe a abụghị ebe a ga-agba bọọlụ n'iro Hannes Halldorsson na-emebu ihe onyonyo tupu o tinye uchu n'ịgba bọọlụ dịka ọrụ ya. O mere ihe onyonyo egwu n'afọ 2012. 4. Ha na-agba bọọlụ n'ime ụlọ Ama egwuregwu ebe e tinyere ọkụ ka ha na-asọmpi afọ niile Oyi dị egwu na-atụ na Aịsland dịka aha ha si dị, ọzọkwa bụ na ọ na-agbakarị ọchịchị na mba Aịsland, n'ọnwa Disemba, e nwereike inwe ọchịchị rue elekere iri abụọ na mba ahụ. Nke ahụ anaghị enye aka ikuzi maọbụ ịmụ ịgba bọọlụ, ya mere ha jiri tinye ego rụọ ama egwuregwu bọọlụ n'ime ụlọ. Ha nwere ama egwuregwu 30 ebe asaa n'ime ha nọ n'ime ụlọ ma pee mpe karịa ama egwuregwu e ji agba bọọlụ. 5. Nke a bụ mbụ ha na-abịa asọmpi Iko Mbaụwa: Aịslandị tozuru ịga asọmpi siriike na mba ụwa nke mbụ n'afọ 2015 oge ha pụtara n'asọmpi Euro 2016 ebe ha meriri mba Netherlands ma merikwa mba Ịngland tupu Frans agbapụ ha n'agba anọ ikpeazụ. Ha tozuru ịbịa asọmpi Iko Mbaụwa 2018 dịka ha meriri Kosovo ọkụ goolụ abụọ n'afọ 2017 we bụrụ mba pekarịchara mpe na mmadụ gara asọmpi ahụ. Ha na Naịjjịrịa ga-asọmpi taa dịka ha na Ajentina gbara onwe ha onye laba onye laba, egwu na-atụ ndị mmadụ na ha nwereike imeri Naịjirịa maka na dịka otu onye siri kwuo, ha anaghị agba maka ego, ha na-agba maka obodo ha." afirika-46209684,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46209684,Abortion: Ị ma na ite ime ga-eduba gị n'ụlo mkpọrọ afọ 14?,"Na Naịjirịa, ite ime abughị ihe mmadụ nwereike banye ụlọọgwụ ga mee.","Nke a bụ maka iwu Naịjirịa megidere ite ime. Mana, etu ọ dị na Naịjirịa abụghị etu ọ dị n'ụfọdụ mba ndị ọzọ. N'ọnwa Mee nke afọ 2018, mba Ireland merụrụ iwu megidere ite ime. Ha ji ntuliaka nke jụrụ ndị mmadụ ma ha chọrọ ka nwaanyị nwee ikike nke onwe ya ite ime. Ụmụaka na okenye pụtara ebe a na-eme ntulịaka n'Ireland Ndị mmadụ dị Pacenti iri isii na asatọ na mba ahụ kwenyere na nwaanyị nwere ikike onwe ya, nke mere na ha nwereike ị sị na ha achoghi ime ha bu. Ọtụtụ mba nwekwara ụdịrị ohere a. Na Naịjirịa, iwu kwuru na naanị mgbe mmadụ nwere ikike ite ime bụ na nwaanyị dị ime nwereike ịnwụ. Mkpọrọ afo asaa na-eche onye ọbụla aka kpara na-ete maọbụ tere ime. Ebe onye nyere aka n'ụzọ ịnye ihe eji tee ime ga-enwete mkpọro afọ atọ. Onye ọ bụ ya tere ime na-ele anya mkpọrọ afọ 14. Mana, iwu a akwụsighị ite ime na Naịjirịa. Nchọpụta e mere maka atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 2018 Global Family Planning kwuru na ime e tepụrụla na Naịjirịa n'afọ 2018 eruola otu nde na ọma(1.3m.). N'akụkọ si n'ọgbakọ atụmatụ ezinaụlọ bụ International Conference on Family Planning bụ nke na-eme na mba Rwanda ugbua kwukwara na ndị tere ime azụụlọ dị 735,000. Ihe ọ pụtara bụ na ọtụtu ime a na-atụrụ na-akwadoghi akwado na a gaa ete ime azụ ụlọ. Dibia Bekee Francis Ezenwankwo gwara BBC na ọ maghị etu ndị a nọ nzukọ jiri nwete ọnu ọgụgụ a, ọ dị ka ihe ndị ọkammụta ma. Ezenwankwo gara n'ihu kwuo na ihe na-ebute ite ime na-abụkarị maka naanị pasenti iri n'ime ụmụnwaanyị na-eme ihe atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 'Family Planning'. O kwuru na ya bụrụ na Naịjirịa megharịrị iwu ji ite ime, ọ ga-eme ka ite ime belata dika o si mee na Saụt Afrịka. Ọghọm ndị dị n'ite ime n'ụzọ na-ezighi ezi: Ndị ọkacha mara n'ihe gbasara ahụike ụmụnwaanyị depụtara ụfọdụ ọghọm ndị a;" afirika-43918183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43918183,Kwụsịnu ichi ehi na-agagharị,"Iji wee gbochi ọtụtụ ogbugbu ndị mmadụ na Benue nakwa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa, gọọmenti etiti akwụsịla ndị ọchị ehị na-agagharị agagharị.","E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo Ọ bụ na ọgbakọ akpọrọ ''National Economic Council''(NEC) ka osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo na ndị gọvanọ 36 nke Naijiria ka nwetere nkpebi. Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuputere nke a ka emechara ọgbakọ ahụ. Gọvanọ Umahi kwuru na NEC amachiela ngagharị ndị ọchị ehị site n'ugwu rue na ọwụwa anyanwu nakwa oke anị Naịjirịa na obodo ndị ọzọ. Nkpebi NEC na-abia ka -ewechara ntụnye alo kọmiti maka ọtụtụ mmadụ a na-egbu ma ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ụgbọ na-alụ ọgụ na ụfọdụ steeti na Naịjirịa. Steeti ndị ga-ebuzọ hụ nkwusị gụnyere Benue, Taraba, Adamawa, Plateau and Kaduna ebe mmadụ ruru nari nari a na-ekwu nwụrunụ maka ọgu dị n'etiti ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo na ọnwa ole na ole gara aga. Otebeghị aka Benue na Taraba wepụtara iwu megidere ichi ehi nagagharị na steeti ahụ iji wee gbochi esemokwu dị n'etiti ndị ochi ehi na ndị ọrụ ugbo. Gọvanọ Umahị so n'ime otu ndị Gọvanọ biara ọgbakọ NEC Gọvanọ Umahi kwuru na ọgbakọ a kwekọrịtara ka-ewepụta ala puruiche ga-enwe ihe eji ebi ndụ ọfụma n'ime ya na steeti ndị ahụ mkpamkpa a ka njọ. O kwukwara na otu ihe sị kwuru ugbua na ọ bụ steeti dika Plateau,Kaduna na Taraba weputarala ya bụ ala maka ichi ehi. Osote onyeisiala Naịjirịa bụ onyeisi ọgbakọ NEC Ihe mere NEC jiri kwụsị ichi ehi ngaghari Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51695394,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51695394,Ndị ụka katọlịk emeela ngagharị maka etu nchekwa ndụ si jọọ njọ na Naijirịa,Ndị ụka Katọlịkị emeela ngagharị ekpere n'ụbọchị Sọnde n'Abuja ị jị gwa gọọmentị etiti na-afọ ejughị ha etu ha sị echekwa ndụ ndị mmadụ.,"Ndị mere ngagharị iwe a gụnyere John Cardinal Onaiyekan, nakwa ndị Bishọp ụka katọlik niile. Ha niile yi uwe ojii ịji gosi iri uju ha Ọ bụ nzụkọ ndị Bishọp haziri ya bụ ngagharị. Ha yikwa akwa ojii iji gosi na ha na-eri ụjụ maka etu nchekwa siri dobe isi na Naijirịa. Ndị nzụkọ a rụtụkwara aka maka ndị ụkochụkwụ atọrọ atọrọ ma ndị nke egburu egbu. Platu steeti Kọmishọna na-ahu maka ahụike na Plateau steeti bụ Dr Lar Ndan ekwuola na ndị Chaina anọ ha dopụrụ iche enweghị ọria Coronavirus. O kwuru nke a mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ ma sịkwa na ọ bụ n'ụbọchi iri maọbụ iri na otu ka ha ga-ahapụ ha. Man City eturula ugo Ndị Man City bukwara iko a n'afọ 2018 na 2019 Ndị otu egwu bọọlụ Manchester City amaburula iko Carabao Cup nke afọ 2020. Nke a bụ afọ nke atọ ha na-amaburu iko a na-enweghị onye mara ha aka. Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka ha ji merir ndị Aston Villa iji turu ya bụ ugo. Ihedioha ka na-aga ụlọikpe Emeka Ihedioha ekwuola na arịrịọ ọ na-arịọ ụlọikpe ọkachasị maka mkpebi ha banyere ntuliaka Imo abughị otu ihe na nke Bayelsa Ihedioha sị na ya anaghị asị ka ụlọikpe kpee onwe ha ikpe kama ya chọrọ ka ewezụga mkpebi ha. Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ na ikpe bụ kpedidere Ihedioha; Ihedioha na-arịọ ka ewsuga nke a. Na nke Bayelsa ụlọikpe kpebiri na onye zọrọ ọchịchị dịka osote Gọvanọ Bayelsa n'okpuru patị All Progressives Congress (APC) bụ Biobarakuma Degi-Eremieoyo etozughi ịzo ọchịchi. Ndị Ọkaikpe nke Mary Odili no n'isi ha sị na nkagbu njem Degi-Emeriewoyo metụtara vootu David Lyon jiri pụta dịka gọvanọ Bayelsa nke mere na ya onwe ya etuzughi. Ha sị na ọchịchị ga-efezi n'aka Douye Diri nke PDP. Lyon na APC gaghachiri ụlọikpe kachasị, mana Ọkaikpe gbarụrụ ihu maka atụmatụ a na ndị ọkaiwu bịara ya bụ ije nde naịra atọ. Obasanjo sị na ekwesiri ịge ntị n'Atụmatụ 'Restructuring' Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bu Olusegun Obasanjo adụọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ maka ịgbajọ atụmatụ ikewa Naịjirịa n'usoro akpọro ""Restructturing"" Obasanjo si na ọ dị mkpa ka Buhari gee ntị okwu a naekwu maka atụmatụ a iji gbanarụ nsogbu nwereike gunyere agha. Onye bụbụ onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden enwetela mmeri mbụ na njem ya ị bụ onye ga-eburu ọkọlọtọ patị Demokrat zụọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka. Ọ bụ Bernie Sanders no n'ihu ndọrọndọro a mana oge a na-ele anya na ọ bụ n'ụbọchị akpọrọ ""Super Tuesday"" ka a ga-ama onye bu oke na mbe ndị fọro n'ọgbọ. N'egwuregwu, Deontay Wilder na Tyson Fury ga-ezute onwe ha ọzọ na Las Vegas taa. Agbanyeghi na Tyson Fury meriri ya na ọkpọ ya pịara n'izuụka gara aga Deontay Wilder achiela aka ka ha zụte ọzọ. Mmadụ abụọ ga-ezute ịku ọkpọ nke atọ ha n'afọ a. A matala mmadụ 100 n'ime ndị zutere nwoke bubatara nje coronavirus Ezigbote nyocha na-aga n'ihu na ọdọ ụgbọelu na Naịjirịa Kọmịshiona na-ahụ maka ahuike na Legọs ekwuola na ha ewepula onye mba Ịtali bu nje coronavirus bata Naịjirịa gawa ebe ọ ga-anata ọgwụgwọ ọka mma. Ọ sịkwa na ya bụ nwoke na-agbake. N'otu aka ahụ, a na-enyocha mmadụ atọ ọzọ si Chaịna gawa ọrụ na platu steeti ka amara ma ya bụ nje ọ dị ha na-ahụ. Nke a na-abịa ka steeti Ogun kwuru na ha amatala mmadụ narị ha na nwaamadị ahụ si Ịtalị bị zutere, ma sikwa na ndị nọ na ""Quarantine"" dị mmadụ iri atọ na itoolu. Ngalaba na-ahụ maka njem n'ọdọ ụgbọelu Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ ""Federal Airports Authority of Nigeria"" (FAAN) gosikwara etu ha siri dịrị njikere maka nyocha nje coronavirus. Ndị mmadụ na-eto kwanụ ha etu ha si agba mbọ, ọkachasị etu ha ji eme karịa ọtụtụ mba ndi ọzọ." afirika-43542925,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43542925,2019: Mmadụ anọ chọrọ ịna Buhari ọkwa ya,"Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC n'aha ịchafụ enyebeghị iwu ka ndị chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'afọ ahụ bido ozi ịchụ nta votu, mana nke a akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ebunobi ha maka ya.","Naijiria ga eme ntuliaka n'afọ 2019 O dobeghị anya ma onyeisiala Muhammadu Buhari ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'ihi na o jibeghị ọnụ ya kwuo na ya ga-azọ. Mana ihe doro anya bụ na o nwere ndị atụghị anya kwupụtara na ha chọrọ ka ha na onyeisiala tinye ụkwụ n'otu traụza na ntuliaka na-abịa. Ndị a bụ ndị ntorobia, ndị ama n'ọrụ dị icheiche dịka ijiegoachụego, ime ihe nkiri, na nkuzi: Ha bụ: 1. Ahmed Buhari Ahmed Buhari,onye a mara dịka 'Ahmed Bee' bụ onyeisi na ihe gbasara technuzu. Buhari, dị afọ iri atọ na itoolu(39) kwuru kemgbe 2016 na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. Nwa amadi ahụ nke enweghị ka ya na onyeisiala Buhari siri metụta kwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ebunobi ya ịchịkọta Naịjiria ọnụ ka udo di, gba mbọ ka enwe nchekwa ya na ọrụ n'obodo. 2. Yul Edochie N'ọnwa Janụarị, onye na-eme ihe nkiri ama bụ Yul Edochie kwuru na igwe okwu instagram na ya nwere ike ịzọ ọkwa onyeisiala ma agbanyeghị na ya emerighị ntuliaka Gọvanọ Anambra nke o soro zọ. 3. Fela Durotoye A mara Fela Durotoye dị ka onye ọka okwu ji ya agba ndị mmadụ ume mana ọ bụ nwa na-awụ ahụ n'afọ n'afọ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Mana nke a akwụsịghị ya ikwupụta na ya ga-azọ. Dịka ọ siri kwuo, oge kwalite ala Naịjiria eruola. ""O tela anyị hapụrụ ndị ọzọ dịka ndị ọrụ gọọmenti, ndị mba ọzọ na na otu mba ụwa ọrụ ikwalite obodo anyị. Anyị hapụrụ ọrụ ime ka Naijiria bụrụ nnukwu obodo n'aka mmadụ ole na ole ndị gosirila anyi ugboro,ugboro na ebumobi dị na ọganighu onwe ha, na abụghị ndị ala anyị maọbụ ọhanaeze. Oge eruola oge iji gbanwe ọnọdụ a."" 4. Olufumilayo Adesanya-Davies Olufumilayo Adesanya-Davies bụ onye ọkammụta na ngalaba asụsụ na nka nzisa ozi nke a kpọrọ'Language and Communication Arts' na mahadum, 'Rivers State University of Education,' bụ sọọsọ nwaanyi kwupụtarala mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ na-abịa. O kwuru: ""A na m ele anya ịbụ onyeisiala Naijiria. Achọrọ m itinye ochi n'ọnụ mmadụ niile."" Mana Adesanya-Davies ekwughị pati ọ ga-eji zọọ ọkwa ahụ. Na nsonso a, okwu na-ada bụ mkpa ndị na-eto eto iweghara ọchịchị nn'aka ndị aka ochie. Nke a kpalitere mkpaliteụka #notooyoungtorun na'eelu igwe okwu intanet. N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu guntyere, Olusegun Obasanjo akpọọla ụmụnwaanyị oku ka ha sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị." afirika-43580157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43580157,Ntuliaka 2019: Ndị isi nchekwa Naịjirịa nwere nchegbu,"Ọ bụrụ na ndị ọrụ nchekwa na-enwe nchegbu gbasara nchekwa na ntuliaka afọ na-abịa, kedụ ihe ụmụ Naịjirịa ga-emezi?","Ndị ọrụ nchekwa gunyere ndị agha ala, agha elu, agha mmiri, DSS, NIA na ndị uweojii Nke a bụ ihe si n'akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba SHehu dere gbasara mkparịaụka ndị isi ọrụ nchekwa na ndị ntaakụkọ nwere n'Abuja. N'akwụkwọ ahụ, Shehu dere; ""Ndị isi ọrụ nchekwa gosipụtara nchegbu ọkachasị maka mkpamkpa ndị ọjọọ na-akpa iji kwatuo usoro a ga-eji mee ntuliaka nke afọ 2019. O kwuru ka ""ndị ntaakụkọ tinye uchu n'ọrụ ha ghara ikwe ka ndị dị etua duhie ha."" Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa ahụ na-ekwu na nchekwa obodo Naịjirịọ́ dị mma karịa etu e si egosipụta ya n'igwe mgbasaozi ndị ntaakụkọ dị icheiche na Naịjirịa. Ha gwara ndị ntaakụkọ ka ha rue ọrụ ha nkeọma ma kwado ndị ọụ nchekwa n'ọrụ ya ịhụ na Naịjirịa nwere nchekwa tọrọ atọ. Gbasara ntuliaka 2019, ha dọrọ ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya maka ụfọdụ otu ọrụ ha bụ ịkwasa ọrụ niile ndị na-achikọba ntuliaka bụ INEC na-arụ. Ndị isi ọrụ nchekwa ahụ gwara ndị ntaakụkọ ka nchekwa na idinaotu Naịjiria buru ụzọ n'ọrụ ha niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 57296023,https://www.bbc.com/igbo/57296023,"Biafra Remembrance Countdown: Onye ọbụla gara mkpa ya, egela 'sit-at-home' ọbụla ntị","Dịka ndị na-achọ nnwereonwe Biafra kwuru ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ghara ịpụta ezi n'ụbọchị Mee 30 na 31 maka emume Ncheta Biafra, ndị gọvanọ etinyela ọnụ.","Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) higharịrị ụbọchị nke ha gaa ụbọchị Monde bụ Mee 31, mana ndị ọzọ kwechiri na ọ bụ Mee 30 ka ha ga-eme emume nke ha. N'ihi nke a, ndị gọvanọ Ebonyi steeti nakwa nke Imo steeti bụ Dave Umahi na Hope Uzodimma, ekwuola sị ndị mmadụ egela iwu 'sit-at-home' a ntị. Ebonyi steeti: 'Ahịa niile na ebe ọgbakọ ndị ọzọ mepee, ụjọ atụla unu' - Gọọmentị Ebonyi steeti Gọvanọ Dave Umahi kwuru sị ndị mmadụ garawa mkpa ha n'ihi na ndị nchekwa nọ na steeti ahụ ga-ahụ na udo ga-achị na steeti ahụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo ka ndị ahịa na ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-agbakọ mepee dịka ha si emebu n'ụbọchị Sọnde na Mọnde, n'ihi na enweghi ihe na-eme. O kwuru na oge a gbara ohu agafeela, na enweghi onye Ebonyi ga-ekwe abụ ohu nke ugboro abụọ. Ọ gara n'ihu kwuo ""Biafra anyị chọrọ bụ inwe ego ka anyị jiri ya kpochapụ ohu ụmụnne anyị dubanyere anyị n'ime ya."" N'Imo steeti: 'Gaanụ ụka ụbọchị ụka, unu egekwala 'sit-at-home' ọbụla ntị - Gọọmentị Imo steeti' Gọọmentị Imo steeti akpọkuola ndị steeti ahụ ọkachasị ndị ụka Kraịst ka ha gaa ụka ma gbachi iwu 'sit-at-home' ndị na-achọ nnwereonwe Biafra tinyere nkịtị. Declan Emelumba bụ Kọmishọna Mgbasaozi steeti ahụ kwuru na enweghi onye nwere ikike ịkwụsị ndị mmadụ ife Chukwu maọbụ napụ ha ikike ha nwere ime okpukperechi ha nakwa nke ngagharị ha. Emelumba kwuru na ndị mmadụ atụla egwu dịka ha na-aga mkpa ha, na ha ga-enwe ezi nchekwa. O kwukwara na ọ bụ ihe ọjọọ na otu ọbụla ga-egbochi ndị mmadụ ife Chukwu nakwa ịchọrọ ihe ha ga-eri n'ihi 'nọrọ n'ụlọ'. O kwuru na gọọmentị etinyela usoro nchekwa dị iche iche iji gbochie ndị ga-achọ imekpa ndị mmadụ na-agara mkpa ha ahụ, ma kwuo na gọọmentị enyela ndị nchekwa ikike igosi onye ọbụla chọrọ inye nsogbu dịka ịnagide ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ, ihe ọkụ ji ntị oke eme. Emelumba kwuru na gọọmentị enyela ndị ji egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ nke iwu akwadoghi ụbọchị ise iji wega ha n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso. O kwuru na gọọmentị ga-agbaghara ndị ọbụla tụhapụrụ ngwaọgụ ha n'ime ụbọchị ise ahụ, ebe ndị na--ekweghi eme ya ga-ata ahụhụ dị n'elu ya. N'Enugwu steeti: 'Unu egela iwu 'sit-at-home' ọbụla ntị, anyị ga-echekwa unu ọfụma - Ndị uweojii Enugwu steeti Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola ka ndị mmadụ gara mkpa ha na-atụghị ụjọ ọbụla, n'ihi na ha etinyela usoro dị iche iche iji chekwa ndị mmadụ, Ha kwuru sị ndị mmadụ egela iwu nọrọ n'ụlọ ọbụla ntị, ma dọọ onye ọbụla maọbụ otu ọbụla chọrọ ịkpalite ọgbaghara na steeti ahụ aka na ntị ka ha chefuo maka ya n'ihi na ha ga-egbochi atụmatụ ahụ. Mohammed Ndatsu bụ kọmishọna uweojii steeti ahụ, gwara ndị nne na nna ka ha dụọ ụmụ ha na ndị ha na-elekọta anya ọdụ ka ha ghara isonye na ndị ga-akpalite ọgbaghara na steeti ahụ. Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo" afirika-49720179,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49720179,Imo Bride Price: Ihe ọ na-ewe iji lụ nwaanyị na Mbaise,Mbaise bụ okpuruọchịchị a ma ama n'Imo steeti n'ala Igbo.,"Ụfọdụ na-ekwu na ego e ji alụ nwanyị na Mbaise buru nnukwu ibu. Mana ugbua, ọ bụ ihe ọzọ mere ka ha bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ ma na-ewu ewu. O si n'ihe onyonyo otu nwa amadi wepụtara na soshal midia na-akatọ ndị Mbaise na omenala alụmdinanwunye ha. Nwa amadi a kpọrọ onwe ya Aloy kọwara etu nwanne ya nwoke si gbahapụ imeego n'isi nwunye ya maka oke ego ndị ọgọ na-ana ya. Content is not available End of Twitter post, 1 Nke a mere ka BBC Igbo kpọtụrụ ndị ma ihe na-aga na Mbaise ka ha kọwaa ihe ọ ga-ewe ịlụ nwaanyị Mbaise. Benedicta Nwokocha Akuezi gwara BBC Igbo n'ekwentị kwuru na 'list' eji alụ nwaanyị dị icheiche dịka omenala ndị sị dịkwa icheiche. N'ọnụ ya ""o nweghi iwu e debere na-ekwu ego ole e kwesiri iji lụọ nwaanyị na Mbaise"" Nwokocha mara atụ sị na ụfọdụ ụmụnna nwere ịkpa aka n'ihe e dere na 'list' ma ọ bụrụ na ha hụ na ọgọ ha ji ezigbo ego. O kwukwara na ezinaụlọ dị icheiche na-eme ihe sọrọ ha ma ọ bụrụ na ọgọ ha nwoke ji ego dịka ị nara ego ""ịkpughe ihu nwaanyị"" ""Nke ahụ esoghi na omenala ndị Mbaise, ọ bụ ịbara nọ n'egwuregwu dị na alụmdi na nwunye ka ihe ahụ bụ"" Usoro e ji alụ nwaanyị Mbaise Nke a bụ ego ndị ọgọ ga-eji kwadoo maka ọbịbịa ndị ọgọ. Ọ kọwara na ụfọdụ ezinụlọ na-etinyekwu ego na ego ma ọ bụrụ na nke ọgọ ha wetara agaghị ezu. Ọ bụ onyeisi ndị amaala ga-agụpụta ihe ndị dị na 'list' mara ma o zuru ezu. O nwere ụfọdụ ihe dị mkpa ekwesighi ifu efu n'ime List ahụ Mgbe ndị ọgọ abụọ kwetara n'ihe niile dị na 'list', ihe ọzọ bụzị ịnwebe aṅụrị Ya bụ ma oriri ma ọṅụṅụ ma ịgba egwu na ihe ndị ọzọ sọ ọlụlụ nwaanyị. Ihe aghaghị ịhụ na ""list"" n'obodo Mbaise Ezenka Udochukwu Agbarakwe - Mmanya ngwọ/mmanya nkwụ . - Ọjị Igbo na ose ọjị. - Mmanya 'Beer'. -Mmanya ọkụ (schnapp) - Anwụrụ, isi anwụrụ, nnu anwụrụ. - Ji (nwereike iru otu narị maọbụ iri ise). - Mmanya ọkụ. - Anwụrụ Bekee. -Ego ive efere - nke a na-emere ụmụnwanyị. - Isi ego. Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma 'N100,000 agaghị azụta ihe niile dị na 'list' Nwokocha kọwara na ụfọdụ ụmụnwoke na-atụnye nwaanyị ime iji gbalahụ 'list' dị oke ọnụ. ""Nke ahụ bụ 'Short Method' ka a na-kpọ ya mgbe anyị nọ n'agbọghọ"" mana n'uche ya otu narị puku naịra (N100,000) agaghị ezu iji gokọta ihe e ji alụ nwaanyị na Mbaise. Dịka o si kọwaa, ego anaghị efu na ime ego isi nwanyị, kama ọ bụ site n'ihe e dere na 'list' ka e si emefu ego. ""Onye chọọ ime akụ nwanyị n'ọnwa Disemba, mmanya na ihe ndị ọzọ ga-aka dị oke ọnụ karịa n'ọnwa Mee"" Mana na ngwụcha, Nwokocha kwuru na ihe dị mkpa bụ ihe onye chọrọ ịlụ nwunye na ndị ọgọ ya kwekọrịtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile" afirika-50485055,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50485055,Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy?,Emume Grammy nke iri isii na abụọ ehibere n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụarị na-ebiri ọkụ na Los Angeles dị na mba Amerịka.,"Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu twitter na-egosi obi anụrị ha na 'Burna Boy' nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ya bụ nturugo. Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na o merie . @CalebChom na-ekwu ego ọ ga-enye maọbụrụ na Burna mabute Grammy End of Twitter post, 1 @FreedomOghenero na-ekwu na obi siri ya ike na Burna ga-amabute ihe nrite a. Cheta na Burna Boy nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ntụruugo kachasị n'egwu bụ Grammy. E debanyere ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'ogogo ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album na Bekee'. Nke a ga-eme ya mbụ Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu, na-abanye na ndị nwereike irite nturuugo Grammy a. Mana ọ bụghị ya bụ onye Naịjirịa mbụ na-enweta ohere a; ndị dịka King Sunny Ade, Fela Kuti, Femi Kuti na ndị ọzọ. 'Soshal midia bill' Gị na-eji soshal midia achọ ndị mmadụ okwu, ị nwereike ịbanye na nsogbu ma e tinye iwu a. Ị chetara iwu megidere okwu akpọmasị ndị ụlọomeiwu ukwu tiputara n'izu gara aga nke a sị na ikpe ya bụ ikpe ọnwụ? E bufekwaala ya ngụpụta nke abụọ ugbua. Obiano na-akasi ndị ahịa Ọchanja obi Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano etiela ndị ọkụ gbara ihe ha n'Ọchanja metụtara aka n'obi ma kwuo na enweghị ụdịrị ego ọ sọrọ ya bụrụ, nwereike ịkpọghachite ndị nwụrụ anwụ. Obiano kwuru nke a ka o du ụfọdụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'Anambara steeti gaa ekpere maka akwamozu nne na nna nwa ọkụ ahịa Ọchanja ahụ gbagburu. Jose Mourinho ga-anọ Tottenham ruo 2020-23 Jose Mourinho ndị Tottenham ka were n'ọrụ, ga-anọ ebe ahụ ruo afọ 2022 na 2023 ma ọ bụrụ na o metaghị ihe e ji chụọ ya. Mourinho na onwe ya kwuru na ọ bụ ụdịrị ndị ọgbabọolụ nọ n'otu ahụ mere akpịrị ogologo isonye otu a. Akụkọ mere ugbua bụ na Jose Mourinho abụrụla onye nchịkọta otu egwuregwu Tottenham Hotspur dịka a chụchara Mauricio Pochettino. Mourinho bụbu onye nchịkọta Manchester United na Chelsea tinyereaka n'akwụkwọ ịnọ n'ọkwa na ngwụcha afọ 2022 ruo 2023. Mourinho sị na ụdịrị ndị ọgba bọọlụ Tottenham nwere na-enye ya obi aṅụrị nke ukwuu. Onyeisioche ndị Tottenham bụ Daniel Levy sị "" N'ime Jose anyị nwere onye so n'otu ndị nchịkọta kachasị mma na bọọlụ"" Cheta na Tottenham chụrụ Mauricio Pochettino n'ọrụ agbanyeghi na o du ha ruo agba nke ikpeazụ asọmpi champịọns league n'afọ gara aga. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Harry Kane bụ onye ndu ndị Tottenham sị na ọ na-abatara Mourinho n'otu ha Matt sị ka a na-atụ anya Bale ịbịa Tottenham ugbua Josephine ugwu atụrụla ugwu Nwada Josephine Ugwu turuugo pụrụiche n'aka onyeisala Buhari maka ego ndị mmadụ furu efu ọ na-eweghachite azụ n'ọdọụgbọelu dị ịche iche na Naịjirịa. Nwaanyị na-arụ ọrụ ihicha ụlọ weghachịrị ọtụtụ nde maịra ego. N'ofesi Mba Izrel akwala mgbọ na mba n'ọtụtụ ebe na mba Siria megide gọọmentị Siria nakwa ndịagha Ịran. Ndịagha Izrel sị na nke a bụ na nzaghachị ọtụtụ ogbunigwe ndịagha Iran gbara n'Izrel. Nkeji ehihie Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Buhari sị ka ehiwe ụlọikpe pụrụiche maka mpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụlọomeoiwu ka ha gbapụ ya ọsọ n'itinye iwu ga-ehiwe ụlọikpe ga-elebanya na mpụ ndị pụrụiche. Ọ kpọrọ oku a n'ọgbakọ e mere iji belata nrụrụaka n'etiti ndị na-arụrụ ọha ọrụ bụ ebe ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nabata atụmatụ a. Ụkọchukwu a sị wakporo nwaanyị n'ike A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya Ndị uweojii Enugwu steeti agbaala otu ụkọchukwu n'anwụ n'ihi ebubo ịwakpo otu nwaanyị n'ike nakwa ịkwọ ọgwụ ego. Komishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ahmed Abdur-rahman kwupụtara nke mgbe ọ na-agba mmadụ iri atọ na isii ndị ọzọ n'anwụ maka mpụ dị iche iche. Ndịagha mba Amerịka abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta mere n'Afghanistan n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba. A ka na-enyocha ihe kpatara nke a mana ndị oyi ndụ egwu kwuru na ha gbaturu ụgbọelu helikọpta ndị Amerịka na mpaghara Logar. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara" afirika-53269503,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53269503,Men's Health: Ọrịa isii kacha emetụ ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị,"Ndị Igbo na-ekwu okwu sị na mmadụ na ibe ya ha bụ n'ọnụ, maka n'ezie, mmadụ niile abụghị otu.","N'otu aka ahụ, nwoke na nwaanyị abụghị otu, ya kpatara na ọrịa ụfọdụ ka emetụta ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị. Oge niile ka ndị ọkachamara na ndị ọkammụta sayensị na-esi imi n'ala ịchọpụta ihe na-akpata ọrịa, mana ọtụtụ n'ime ha ekwekọrịtala na ụfọdụ ọrịa na-abịara mmadụ n'ihi na onye ahụ bụ nwoke maọbụ nwaanyị. Akụkọ a ga-agbado ụkwụ n'ọrịa ndị kacha emetụta nwoke karịa nwaanyị. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: 1) Ọrịa Agede (Prostate ailments) Agede nwoke (prostate) Nwoke ọbụla katawarala ahụ kwesịrị ịga mee nnyocha mara ma agede ya akwụkwa chịm. Agede bụ akụkụ ahụ nke Bekee kpọrọ 'prostate'. Ọ bụ mkpụrụ dị n'etiti amụ na akpa mamịrị. Akwara si akpa mamịrị gafere n'ime ya. Ọrụ agede, dịka ndị ọkammụta sayensị siri dee bụ imepụta mmiri na-enye miri utu aka. Ọrịa na-emetụta agede nwoke gụnyere: Okuko Agede (Prostatis), Agede itofe oke (Prostate Hypertrophy) na Akpụ Agede (prostate cancer). Ọ bụ ịṅụ ọgwụ maọbụ ịwa ahụ ka e ji agwọ ọrịa ndị a. Ọ na-adịkwa mma ma onye bu ọrịa a chọpụta ya n'oge, ka o nwee ike malite ịnata ọgwụgwọ ọsịsọ. 2) Okwute akpa mamịrị (Bladder stones) Ọrịa okwute akpa mamịrị na-eme ka ịnyụ mamịrị na-afụ ụfụ Nke a bụ mgbe ihe dịka kịrịkịrị okwute malitere ịpụta n'akpa mamịrị mmadụ. Ihe na-akpata nke a bụ mgbe ihe na-emepụta mamịrị gbakọrọ ọnụ ma kpọọ nkụ n'ime ahụ mmadụ. Nnyocha gosiri na ọrịa a karịrị n'ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị. Ndị ọkachamara kwukwara na ọrịa a na-aka njọ ma nwoke katawa ahụ, ihe dịka malite n'afọ iri ise gbagowe. A na-eji ịwa ahụ nke ""Transurethral cystolitholapaxy"" bụ otu usoro n'ime ya were agwọ ya. Mana ndị ọkachamara na-adụkwa ọdụ ka onye bu ọrịa a na-aṅụ mmiri iji kpochapụta ya. 3) Ọrịa akpụ (Cancer) 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije' E wepụ ọrịa akpụ nke ara bụ 'breast cancer' na Bekee, nnyocha gosiri na ọ bụ ụmụnwoke ka ọrịa akpụ ndị ọzọ kacha emetụta. Ndị a gụnyere ọrịa akpụ nke ọnụ (oral cavity cancer), ọrịa akpụ nke mgbịrịafọ (colon cancer), ọrịa akpụ nke akịrị (kidney cancer), dgz. Ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na nke a nwere ike ịbụ maka na ọ bụ ụmụnwoke na-emekarị ihe nwere ike ịkpata ụdị ọrịa ndị a, dịka ise anwụrụ nakwa ịṅụ mmanya na-aba n'anya. Otu ụzọ a na-ejikarị agwọ ọrịa ndị a bụ site n'iwa ahụ. 4) Ọrịa Pakịnsịn (Parkinson's Disease) Ọrịa pakịnsọn bụ mgbe ike malitere ịgwụ ụbụrụ mmadụ ma onye ahụ kawa nka na-akpata ya. Ọ bụ ma mmadụ kawa nka ka ya bụ ọrịa na-apụtakarị ihe. Otu ihe e ji ama ya bụ aka ịma mmadụ jijiji n'ihi na ike agwụla njikọ ọkpụkpụ nakwa anụahụ. Ndị nnyocha kwuru na ọrịa a ka njọ na nwoke karịa na nwaanyị. Muhammad Ali bụ ọpịa ọkpọ bụ otu onye a ma ama rịara ọrịa a tupu ọ nwụọ. Ruo ugbua ọrịa a enwebeghi ngwọta, mana a na-enye ndị mmadụ ọgwụgwọ na-enyere ha aka ibi ndụ ha, site n'ịṅụ ụfọdụ ọgwụ nakwa ịwa ahụ nakwa nke Bekee kpọrọ ""physiotherapy"". 5) Mkpọnwụ ahụ (Stroke) Ọ bụrụ na ọbara anaghị eru n'ụbụrụ mmadụ nke ọma, o nwere ike ime ka 'cell' dị n'ụbụrụ nwụọ. Nke a mee, o nwere ike ime ka otu akụkụ ahụ mmadụ maọbụ nke ọzọ kpọnwụọ. Ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ gụnyere oke ise anwụrụ, oke ibu, ọrịa shuga, ọke mmanya na-aba n'anya, anaghị emegharị ahụ, dgz. Nnyocha gosiri na ụmụnwoke ka enwe ọrịa mkpọnwụ ahụ karịa ụmụnwaanyị. Mana ọrịa a ka emesi ụmụnwaanyị ike ma o mee ha karịa ụmụnwoke. 6) Ọrịa obi (Heart disease) Ọrịa obi nke kacha emetụta ụmụnwoke bụ nke a kpọrọ 'coronary heart disease' na Bekee. Ihe na-akpata ya bụ mgbe ọbara anaghị erucha n'obi mmadụ otu o kwesịrị. Ọtụtụ ihe na-akpata mkpọnwụ ahụ (stroke) bụkwa ha na-akpata ọrịa obi. Nnyocha gosiri na ọrịa obi na-aka ejitu ụmụnwoke karịa ndị nwaanyị. Ụzọ kacha mfe e si agwọta ọrịa obi bụ ma a chọpụta ya n'oge. Ya kpatara ime nnyocha kwa mgbe kwa mgbe ji dị ezigbo mkpa. Ọrịa atụghị nwaanyị ime Ọrịa ọzọkwa na-emetụ ụmụnwoke enweghị ike ịtụwa nwaanyị ime. Nchọpụta gosiri na ọrịa a na-agbali elu ugbua n'ime ụmụnwoke. O nwere ọrịa dị icheiche nwere ike igbochi nwoke ịtụwa nwaanyị ime. Nke mbụ bụ mmechi mpio ebe ughe si apụta (sperm blockage), nke abụọ bụ ụghe anaghị agbazu agbazu (low sperm production), nakwa ughe anaghị akpa agwa etu o kwesịrị (abnormal sperm function). Ise anwụrụ, ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oke mmanya, ibu oke ibu, dịrị gawazie, socha na ihe nwere ike ịkpata ụdị ọnọdụ a. Ihe ndị a nwere ọgwụgwọ ma a malite n'oge lebanye ya anya. Mana nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji aka ya mee. Onye nwere ụdị ọrịa a kwesịrị ịga ụlọọgwụ ka dọkịta nyere ya aka." 42852458,https://www.bbc.com/igbo/42852458,Ndị so na nke afọ a banyere n'ụlọ taa,Nde naịra iri anọ na ise ka mmadụ iri na isii na-agba ọsọ ya na ihe ngosi Big Brother Naija nke afọ a.,"Ebuka laghachitara azụ dịka onye na-achịkwa ya bụ ihe ngosi Agba nke atọ ya bụ ihe ngosi malitere taa dịka ndị so na ya banyere n'ụlọ ebe ha-anọ ọnwa atọ. Ihe a kpọrọ ihe nkiri nke afọ a bụ ""BBN: Double Wahala"". Ụmụ Naịjirịa ebidola ikwuokwu gbasara ya bụ ihe nkiri. Demola Expoze gosipụtara ndị mmadụ iri na abụọ buru ụzọ banye n'ụlọ End of Twitter post, 1 Ọrụ ndị nọ n'ihe nkiri nke agba bidoro n'ọnụụzọ ka ha na-abanye. Mmadụ iri na isii nọ n'ụlọ BBN afọ a Mmadụ anọ bu ụzọ banye n'ụlọ bụ ndị a 1. Anto 2. Cee-c 3. Lolu 4. Tobi Mmadụ anọ ndị soter ha bụ 1. Alex 2. Dee-one 3. Princess 4. Miracle Ndị nke atọ bụ 1. Ahneeka 2. Rico Swavey 3. Bam Bam 4. Peto Ndị nke ikpeazụ bụ ndị a 1. Leo 2. Khloe 3. Angel 4. Ifu Otu ihe dị iche bụ na ndị niile so n'ihe nkiri a nke afọ nwere ezigbo aka ọrụ bụ ihe na-emepụta tupu ha abata n'ụlọ." egwuregwu-43890260,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43890260,Real Madrid na Bayern ga-achịpụ ya taa,N'abalị a mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ (7:45 pm) ka ndị Bayern Munich nke Spen na ndị Real Madrid nke Jamani ga-ama ọkaibe na ọgbọ egwuruegwu nke Allianz Arena.,"Cristiano Ronaldo e nyela golu 42 kemgbe amalitere ịgba bọlụ nke a afọ a Ndị otu egwuruegwu abuo a abu asụ anwuru n'asọmpi. Ya mere ndị na-so ya ji esi ọnwụ na ọ ba ndị nke ha ga emeri. Mana cheta na onye ndụ ndị Bayern Munich bụ David Alaba e soghị sọọ mpi nke eji akwado bọlụ nke emere ụnyahụ maka ahụ omeruru na apata. Robert Lewandowski e nyele golụ 39 na ọgba a Onye nkuzi ha bụ Jupp Heynckes si na ọ bụ tata ka a ga-amata ma Alaba a ga-so mgbaa tata. A na-atụanya na Rafinha nke sị mba Brazil nwere ike ịnọchị anya Alaba ma ọ bụrụ na ọ gbaghị. A na-elekwa anya na James Rodriguez nwere ike ibido asọmpi ahụ. Gee ntị ka ị nụ onu ndị n'so Bayern. Ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ maka asọmpi a ekwekọrịtaghị ndị ga-emeri na-egwuruegwu a Zinedine Zidane bụ onye nkuzi ndị Madrid sị na ha nwere olile anya na-agbanyeghị na ha enwetachaghị golu niile ha kwesiri ịnye na asọmpi ndị gara aga. Dịka osiri kwuo, ""n'egwuruegwu bọlụ, ihe ọ bụla nwere ike ime"". Ọ sịrị na ya agaghị akarụ ụbọchị ma chị ejighi. Gee onye nkwado ha ntị n'olu. Ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ maka asọmpi a ekwekọrịtaghị ndị ga-emeri na-egwuruegwu a Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43576604,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43576604,Mgbanwe ego Google mere: Dọla ọdaala n'akụkụ Naịra?,Ụbọchị Maachị 27 nke 2018 bụ nke ọtụtụ ndị na-agaghị echefu ọsịsọ maka ndeghie ndị Google dere gbasara mgbanwe ego n'etiti Dọla na Naịra.,"Dọla bidoro irigo elu karịa Naịra n'afọ 2016 Ka ndị mmadụ gara n'igwe okwu ịntanetị ụbọchị ahụ, ha hụrụ ka Naịra si kwụrụ chịm n'akụkụ Dọla nke gosiri na ijiri naịra 182.16, ị ga-azụtanwu otu dọla, kama naịra 360 ọ nọrọla kamgbe ọnwa ole na ole. Nke a pụtara na dọla ji ihe ruru pasentị 100 daa. Ka ndị Naịjirịa bidoro na-ekesa akụkọ a, ụfọdụ kwenyere na ọ bụ eziokwu, ebe ndị ọzọ kwuru na odoghị ha anya. Mana ọ pụtara na ndị Google deghiere ihe ha chọburu ide. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya Ụfọdụ na-achọ ndị ga-akọwara ha ihe na-eme Ndị ọzọ kwuru na ọ bụ asị, na onweghị ike ime N'ikpeazụ, ndị Google degharịrị ihe mgbanwe ego kwesịrị ịbụ, mana ha ekwuputabeghị ihe metere ọdịrị mmehie jiri mee." afirika-49944182,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49944182,Chibok Girls: Ha anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram,Ụmụaka Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram,"Akụkọ dị mkpa: Otu Bring Back Our Girls na ndị nne na nna etiela mkpu n'oke olu maka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok ka nọ n'aka ndị Boko Haram kamgbe ihe karịrị afọ ise. Ha na-ebe akwa na gọọmentị achọghị ịgba mbọ ka a tọhapụ ụmụaka 112 fọrọ afọ n'ime ihe karịrị 200 a tọọrọ. Otu a riri uju iji chetara ụbọchi puku abụọ ụmụaka ndị nọrọla n'aka ndị Boko Haram bụ ndị tọrọ ha n'ụbọchị 14 Eprelu, 2014. Otu BBOG wepụtara akpụkpụ dị 112 e dere aha ụmụaka ndị a, nke Leah sheribu na ndị ọrụ enyemaka abụọ Alice Ngaddah na Grace Taku. Ha gosiri akpụkpụ ụkwu ndị a n'ogige Unity Fountain dị n'Abụja n'ụbọchị Satọde bụ abalị ise nke ọnwa Ọktoba afọ 2019. Nyesom Wike emeriela n'ụlọikpe Ụlọikpe dị na Rivas Steeti ekwuola n'ezie na ọ bụ gọvanọ Nyesom Wike meriri na ntuliaka afọ 2019 dịka ọkaikpe K.A Ojiako si kwuo. Ụlọikpe a sị na onye ji aha ADP zọọ ọkwa gọvanọ mere mkpesa bụ Victor Fingesi ga-akwụ ụlọọrụ Inec, gọvanọ Wike na PDP ego dị puku narị naịra atọ n'otu n'otu. N'ofesi Ihe ruru mmadụ otu narị anwụọla na ngagharịiwe na-eme na mba Iraq megide gọọmentị ha. ebe ihe karịrị mmadụ puku atọ merụrụla ahụ n'ọgbaghaara ahụ. N'egwuregwu Tottenham makwara afọ n'ala ọzọ dịka Brighton ji ọkpụ goolu atọ saa ha ahụ n'asọmpi Premier league Nke a ga-eme ugboro atọ a ga-emeri ha n'ime otu izuụka. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri 'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ' Onyeisiala Buhari na ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka Ụmụ Naịjirịa ha na onyeisiala Buhari nwere ọgbakọ na Saụt Afrịka Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka.N'ofesi, Ụmụ Naịjirịa gbakọrọ na mba Saụt Afrika ịzụte Onyeisiala Muhamdu Buhari ebesalara ya akwa arịrị maka ụdị mkpagbu na mkpachapụ chere ha n'ihu na mba ahụ. Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika bụ S J Uba tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka. Ndị otu a gwara Buhari na ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa na dị mba ahụ na elegere ndị Naịjirịa anya ka ndị ekperima. Ihe ọzọ pụtara na njem Saụta Afrịka onyeisiala mere bụ na mba abụọ ahụ ekwekọrịtala ị na enye visa afọ iri n'ofu nje maka ndị ọchụnta ego, ụmụakwụkwọ na ndị na-emekarị njem. Nasir El-Rufai sị na ụmụaka ahụ atọọrọ ga-apụata Ụnụ anụkwanụ e, na ndị ntọ tọọrọ ụmụ agbọghọ isii n'ụlọakwụkwọ dị na akụkụ Kaduna ụbọchị tọzde akpọọla okwu aha ihe a ga-enye ha tupu ha tọhapụ ụmụaka ahụ. Gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai sị na ha na ndị ahụ na-ekweọnụ, mana o kwughị egoole ha kpọrọ aha. Ụmụ Aba ka na-ebe maka ọkụ agbara Ndị mmadụ na mpagaghara Aba ka na-eti mkpu maka mkpamkpa ha sị na ndi uweojii kpara n'ogige ha n'izu a. Ọfọdụ ndị agbara akụnaụba ha ọkụ sị na ndị uweojii ha sị kpara ike a bịara njem mmebi ihe ruo ugboro ano kemgbe nsogbu a malitereka dịka ndị amatabeghị gburu onye uweojii. Onyeisi ndi uweojii n'Abịa bụ Eneh Okon na-agọ na ọbụghị ndị ọrụ ya mere ihe a. Egwu họrọ Dele Alli N'egwuregwu, egwu ahọọla nwafọ Naịjrịa na-agbara Ingladị bụ Dele Alli n'asọmpi Urop 2020. Nke a dị na-akwụkwọ onye nkuzi Inglandi bụ Gareth Southgate biputara n'izu a. Gee akụkọ ndị niile n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43682546,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43682546,Izu Afrịka na foto: Site na Maachị 30 ruo Epreelụ 5 nke 2018,Nhọpụta foto kacha mma si na mpaghara Afrịka na nke ndị Afrịka nọ ebe ndị ọzọ n'ụwa n'izu a.,"Otu nwoke dina n'ala ka a na-eme ejije mkpọgide n'obe nke Jesu Kristi ụbọchị Good Fraide na Legọs, Naịjirịa... A na-akasi otu nwaagbọghọ obi ka ọ na-ebe akwa oge a na-eme ejije mkpọgide n'obe a. Ebe nwokoroọbịa a ji obi umeala ekpe ekpere n'isi obodo Kenya bụ Nairobi. Harun Karanja bụ onye nwe ụlọahịa Facebook Curio, ji ekwentị ya elebanye anya na Facebook ya na mpaghara Rift Valley dị na Kenya. Otu nwoke na-arụ ọrụ ebe a na ewu ụlọ n'obodo Goma dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mba Democratic Republic nke Congo... Ebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ n'elu osisi eji akwado ụlọ nke bekee kpọrọ scaffolding. N'ụbọchị Mọnde n'obodo Durban dị na mba Saụt Afrịka, ahụrụ foto Winnie Madizikela-Mandela bụ onye na-alụ ọgụ megide ịkpa oke agbụrụ, ka a na-amụrụ ya anya abalị ka ọ nwụrụ oge ọ dị afọ 81. Ebe ụmụnwaanyị a na-agụ egwu iji kwanyere oriakụ Madikizela-Mandela ugwu n'obodo Soweto ebe o bibu nakwa ebe ọlụtara ọgụ mmegide ịkpa oke agbụrụ. N'obodo Tunis bụ isi obodo Tunisia, ndị otu nche nkwanyeugwu mere ngosipụta n'ụbọchị Wenesde na nzukọ nke afọ 43 nke ndị otu Islamic Development Bank. N'ime otu ụbọchị ahụ n'Australia, Salome Nyirarukundo bụ onye Rwanda bu ọkọlọtọ ndị mba ha n'emume mbido asọmpi egwuregwu Commonwealth. N'ụbọchị Fraịde, onye a na-eji egosi ejiji gosipụtara otu ekike n'izu eyimeeyi nke Accra. N'ụbọchị Satụde, otu nwaanyị tụnyere vootu ya ka e mere ntuliaka nhọpụta onyeisiala Sierra Leone nke agba abụọ. Ndị mmadụ nwere aṅụrị n'obodo Freetown n'ụbọchị Wenesde ka akpọpụtara aha Julius Maada Bio dịka onye meriri. Ndị nwe foto a bụ AFP, Reuters, EPA na Getty Images." afirika-49440189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49440189,Anyị na-enyocha ọnwụ nwaanyị e gburu n'ugbo n'Enugu - Ndị uweojii,"Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ọnwụ nwaanyị e nwetara ozu ya n'ugbo ya dị na Nchatancha dị n'Emene, Enugwu steeti.","Nke a na-eme dịka ndị ntọrọbịa mpaghara Nike na Nchatancha dị n'Emene mere ngagharịiwe maka ọnwụ Pat Ngwu nke ha na-ebo ndị ọchịehi ebubo igbu nwaanyị ahụ ma tọgbọ ozu ya nso ikpere mmiri. Ụmụokorobịa ji osisi ma mụnye 'tyre' ochie wụjuru okporoụzọ mana ndị uweojii bịara chụsaa ha. End of Twitter post, 1 Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu, gwara BBC n'ezie na e nwetara ozu otu nwaanyị nwụrụ n'ugbo ya, onye o kwuru na 'Anyị na-enyocha ihe gburu nwaanyị ahụ."" ""E nwetara ozu nwaanyị n'ebe ọ gara ọrụ na Nchatanchata na mpaghara Emene Enugwu."" N'okwu ngagharịiwe e mere, Amaraizu kwuru na ndị uweojii gbalịrị mee ka ebe niile dajụọ ka ọ ghara ibute tigbuo-zogbuo. ""Ka ọ dị ugbua, anyị na-esi imi n'ala iji mata ihe mere ya."" Amaraizu kwuru na ya enweghị ike ikwu ụdị ọnwụ nwaanyị ahụ nwụrụ. O kwuru na ya ""enweghị ike ikwu na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ọ dị ime, ọ bụ onye dọkịta ga-agwa anyị ma ọ dị ime maọbụ na ọ dịghị ime"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45878597,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45878597,Osisioma Pipeline explosion: Mkpu ka na-ada n'obodo,"Ụlọomeiwu ukwu Naijiria enyela iwu ka ebido nyocha ihe mere na n'Osisioma Abia steeti, ebe ọkụ gbagburu ihe karịrị mmadụ 150.","Ọ bụ ndị gara iku mmanụ ụgbọala ka ọku gbara Sinetọ na-anochite mpaghara ahụ bụ Theoodre Orji onye welitere okwu ahụ n'ọgbakọ ha n'ụlọomewu sineti ụbọchị Wenezde, rụrụ ụlọọrụ NNPC aka n'ọdachi ahụ. End of Twitter post, 1 Sinetọ ndị Igbo tụnyere ọnụ gụnyere Victor Umeh na Mao Ohuabunwa. Ha kwuru na ọ bụ maka NNPC na DPR ndị ọ dịrị hapụrụ ọrụ idozi okporo mmanụ ahụ oge ọ gbapuru na agbanyeghị na e wetara ha ozi mere ka ọdachi ahụ mee. Akwa arịrị na-ari onwe ya elu n'obodo Ụmụduru na Ụmụimo dị n'okpuru ọchịchị Osisioma, n'Abia steetị ugbua n'ihi na ihe karịrị mmadụ ole na ole nara n'iyi na ọkụ. Ya bụ ọkụ kpara mkpamkpa ahụ na ụbọchị Fraịde gara aga, oge ọkụ bara okporo igwe na-ebụ mmanụ agbịdị. Ebe ụzọ mmanụ agbidi si ga. Mgbe BBC rutere na Umuduru ebe ndị nwụrụ anwụ ka n'ọnụ ọgụ, ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ kwara arịrị na otela ha jiri na-agwa ụmụ ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ. Dịka ndị gọọmenti siri bupusịa ozu ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ ngwongwo ha ji amị mmanụ ka tọgbọrọ ebe ahụ. Obodo nke abụọ ya bụ okporo Igwe mmanụ ghọrọ ọkụ bụ, Umuimo. N'Umuimo, ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ gbara ọkụ. Ụfọdụ ụlọ nara iyi n'ọkụ a gbara Otu nwoke ụlọ ya gbara ọkụ bụ Chuks benson Uzoije kwara arịrị na mmadụ atọ nọ n'ụlọ ya ka ọkụ gbagburu ụbọchị ahụ. Ndị ahụ ọkụ gbara bụ di na nwunye na otu nwa aghọghọ bi n'ụlọ ya. O kwuru na kamgbe Fraịde izuụka gara aga ọkụ a gbara na ya na arahụ n'ụlọ onye ọzọ, ma yirikwa nanị otu akwa. Ọba ndi mmadu ji ga iku mmanụ ụgbọala Ụmụ nne ya bụ nwoke ndị nwanyị mmadụ atọ siri Legọs nakwa Calabar ebe ha na di ha bi were bịa ịhụrụ ụlọ nna ha juputara na anya mmiri n' ụlọ nna ha adịghịzịkwa." egwuregwu-49146745,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49146745,Arsenal vs Lyon: Ekwe akụọla Arsenal n'isi,Moussa Dembele ji goolu abụọ gbarie ndị Arsenal obi ka ha zutere ịzọ Iko Emirates.,"Na Pierre-Emerick Aubameyang nyere otu goolu na nkeji 35 e ji bido bọọlụ azọghị ha n'aka Lyon. Arsenal nọ na-akpa ike ka goolu mbụ ahụ wụbara na mpio, mana ha amaghị ihe chere ha n'ihu makana Dembele bịara tete n'ụra n'ọkara nke abụọ ma zuo ha ike n'ahụ. Goolu abụọ nyere Lyon mmeri 2 - 1 ha ji merie, sụbachara na nkeji 66 na nkeji 76. Gabriel Martinelli Arsenal ka zụrụ azụ chere na ọ gbakpuola goolu mbụ ọ na-enye dịka onye Arsenal ka batara ọhụrụ, mana a gụfuru ya tupu Dembele emewaa ha obi. N'agbanyeghi na ọ bụ asọmpi enyi na enyi, ọ bụ asọmpi ndị otu egwuregwu ndị ụlọọrụ Emirates na-akwado, na-agba kwa afọ. Mustafi na ndị otu ya kpudoro ihu n'ala ka obi na-agbawa ha maka mmeri e meriri ha Ndị otu egwuregwu abụọ a gbachiri nkịtị ka otu nkeji gafee; iji kwanyere Jose Antonio Reyes nwụrụ anwụ n'ọnwa Juun ugwu. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Aubameyang kọwara ihe mere o jiri hụ Arsenal n’anya" afirika-46950397,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46950397,Olusegun Obasanjo: Ihe Atiku ji kara Buhari mma,"Na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere, onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bụbu osote nakwa onye na-azo ọchịchị na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 bụ Atiku Abubakar.","O sị na asị ya hara ugbua na ya ga ahara Atiku karia Buhari n'ihi ihe Buhari merela. ""Ndị e nwere ịhọrọ n'etiti ha bụ onye nke APC na nke PDP. Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghị ọrụ ma ncha, ịkpa oke, nrụrụaka, adịghị ike ahụ, adịghị ike nke uche na ihe niile ndị ọzọ were ya tụnyere Atiku. Atiku ga-agbali mmaji abụọ karịa Buhari."" O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC). Obasanjo kọwara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapụ ikwado ndi ntoroọbịa n'ime mmadụ 73 na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa. O kwukwara ihe mere tupu ndị agha wakpo obodo Odi n'afọ 1999, bụ mgbe ihe ruru mmadụ 2500 ndị obodo nwụrụ n'aka ndị agha. Mkparịtaụka a ga-apụta n'uju eche bụ ụbọchị nke 22 nke ọnwa Janụwarị 2019. N'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garuba Shehu kwuru na ahụ adịghị Obasanjo na o kwesịrị ị ga-ahụ dọkịta. O kwukwara na ọ bụ anyaọkụ na-enye Obasanjo nsogbu. Akukọ ga-amasị gị:" afirika-44399343,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44399343,"Juun 12: FFK, Fayose, nwa Abiola kwadoro ihe Buhari mere","Amaghị ha dịka ndị enyi onyeisiala Muhammadu Buhari, mana aka na-achị Ekiti steeti bụ Gọvanọ Ayo Fayose na onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode kwadoro mgbanwe Buhari mere ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.","MKO Abiola bụ onye e chere na o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993 Ụbọchị Wenesde bụ Juun 6 2018, Gọọmenti etiti Buhari nọ n'isi ya higharịrị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya site na Mee 29 ga Juun 12 iji kwanyere MKO Abiola bụ onye e chere na o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993 ugwu. Fani-Kayode toro Buhari maka nke a sị ""A na m ekele Buhari maka ịma ọkwa na Juun 12 bụzị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ. "" Ihe gbasara Buhari na ọchịchị ya anaghị amasị Fani-Kayode O kwuru: ""Ihe a bụ ihe kwesịrịla ka e mee kemgbe ma tụkwa m n'anya. ""Ana m ekele ya maka ịkwanyere MKO Abiola, onye meriri na ntuliaka onyeisiala e mere na Juun 12 afọ 1993 site n'inye ya nzere GCFR. Nke a bụ nnukwu ihe!"" N'okwu ya, Gọvanọ Fayose kwuru na MKO Abiola kwesiri nkwanyere ugwu nke mere na ndị Ekiti kwanyeere ya ugwu site na ime ụbọchị Juun 12 ụbọchị ezumike na steeti ahụ. Fayose: Anyị mere Juun 12 ụbọchị ezumike iji kwanyere Abiola ugwu Ọ gara n'ihu kwuo na nkwanye ugwu kachasị e nwere ike inye Abiola bụ ikwanyere iwu ala anyị ugwu na ime ka ntuliaka ghara inwe wuruwuru maọbụ magomago ọbụla. Nwa MKO Abiola bụ Hafsat Abiola-Costello sokwa na ndị tinyere ọnụ n'ihe a mere. E gburu Kudirat bụ nne Hasfat Abiola-Costello ma bụrụkwa nwunye MKO Abiola maka okwu gbasara Juun 12 N'ozi o wepụtara, Abiola-Costello kwuru na ime Juun 12 ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ, ma nyekwa MKO nzere GCFR, Kingibe GCON nakwa Gani GCON n'otu ụbọchị, na-egosi ""obi m gbawara agbawa na ịkwụwa aka ọtọ, inye onye oke ruru ya, nakwa nkwanyere ugwu, ka dị ndụ n'ala ndị mụrụ m ji ndụ ha chụọrọ aja."" Ọ gara n'ihu sị: ""Onweghị mkpụrụ okwu nwere ike ịkọwapụta udị afọ ojuju na ọṅụ m nwere. Ana m ekele Chineke na m dị ndụ hụ taa."" Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-43110003,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43110003,Iceland nwere ike ịmachi ibe ụmụnwoke ugwu,Ndị Iceland na-akwado ibụrụ mba mbụ n'Europe ga-amachi ibe ụmụnwoke ugwu.,"Iceland ekwuola na ibi ubu na-emebi ihe rutere ụmụaka Ha na-eme nke a, ebe ụfọdụ mmadụ na-akọwa na ibi ugwu bụ ihe ndi Jew na ndị Alakọba jiri mee mkpa, ihe a bụ mgbe mbụ ndị Iceland ga-alụ ọgụ banyere ofufe. Otu akwụkwọ dị n'ụlọ omeiwu ukwu na Iceland na-ekwu ka enwe iwu ga-eme ka ndị mmadu biri ugwu ga mkpọrọ afọ isii, okachasi ma ọbụrụ na ọbụghị maka ihe metụtara ahụike ka ha ji mee ya. Ndị na-akatọọ atụmatụ ahụ kwuru n'okwu a nke buterela nsogbu n'etiti ndị isi okpukpere chị dị icheiche na Europe, na-aga n'iru na-akọwa na ọ ga-eme ka ndị Jew na ndị Alakọba taa afụfụ. Otu n'ime atọ ụmụnwoke n'ụwa niile bịrị ugwu. Ọtụtụ n'ime ndị a mere nke a n'ihi okwukwe. Ọtụtụ n'ime ndị Jew na Ndị Alakọba na-atụ ụjọ na okwu ibe ugwu nwere ike buru ihe a ga-eji kpụrụ ha n'ọnụ. Ha na-arụtụ aka n'uwe ha na aja eji anụmanụ achụ nwetara ha nsogbụ. Ndị isi ndị Alakọba na ndị Jew anabataghị atụmatụ a. Ụkọchuchwu Reinhard Marx bụ onyeisi ndị Catholic na Europe kwuru na iwu ahụ a na-akwadọ i webata bụ mwakpo ebe okwukwe dị ịcheịche nọ Gọọmenti ndị Iceland ekwuola na ibe ugwu ụmụnwoke na-emebi ikike ruru ha dịka ụmụaka, ha tinyere ya n'ọnọdụ ibi ugwu nke ụmụ nwaanyị nke ọtụtụ Europe gbochiri n'iwu ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51065331,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51065331,Ihe ụmụakwụkwọ chọrọ ide JAMB na-agabiga maka inweta akara NIN,"Ihe karịrị ụmụakwkwọ puku abụọ bụ ndị wụsara n'ụlọ ọrụ MIMC n'Enugwu n'ihi na Jamb amaala ọkwa na onye ejighị ya bụ ""national Identity number""(n'Enugwu,Legọs) agaghị ele ule ahụ na 2020.","Ụmụakwụkwọ gara ịnata akara NIN n'Oshodi,Legọs Ụmụakwụkwọ ahụ na awụghari ụlọ ọrụ ndị NIMC ahụ nke dị na Emene Enugwu dịka igurube. Nwata akwụkwọ anyị gbara ajụjụ ọnụ bụ Maduabuchi Kingsley kwuru na ọ bụ ka mgbe afọ gara aga ka ya malitere gawa ije inweta ya bụ NIN. Ụfọdụ mmadụ na-ajụ ihe kpatara o jiri daa ọtụtụ ụmụakwụkwọ na mberede dịka Jamb marala ọkwa ahụ afọ gara aga. Otu n'ime ụmụakwụkwọ o metụtara bụ Kingsley Mmaduabụchi gwara BBC Igbo na ya bidoro ịgba mbọ idenye aha ya n'afọ 2019. "" A chọrọm ịdị ka Einstein - Ekene Franklin Ezeunala ""M bịa , ha sị m bịa echi, ya bụ, ọ bụghị taata ka m bịara."" Lekwa agwọ loro nde naira 36 Kingsley tụtụ arịrị na""ndị mmadụ karịrị. Ha na-elekwa anya n'ihu were enye ya."" Mana kwaa arịrị na ka ọ dị ugbua na ya enwetabeghị ya n'ihi na ọghọtaghị ihe mere ndị ọrụ NIMC ji asị ha bịa ta bịa echi. Ụmụakwụkwọ gara ịnata akara NIN n'Enugwu Ụmụakwụkwọ ndị ọzọ kọwakwara na ha ataala ahụhụ nke ukwuu iji nata ya bụ NIN wee yọọ gọmenti ka ha mee ka usoro ịnweta ya diwanye mfe ka ha wee ghara inwe nsogbu na Jamb. Ka ọ dị be oke, ka ọ dị na be ọgịnị dịka ụmụakwụkwọ nọ na Legọs na-agabigakwa otu ihe ahụ. Igwurube ụmụakwụkwọ juputara n'ọtụtụ ụlọọrụ NIMC dị na Legọs. Otu nwaakwụkwọ bịara n'ụlọọrụ NIMC dị n'Okpuruọchịchị Oshodi na Legọs achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ike ya bụ ahụhụ agwụla ya, na ya ga ala chere Jamb afọ ọzọ. Kepukepu na-efegharị na soshal midia na ebokwa ebubo na a na-ana ụmụakwụkwọ aka azụ tupu enye ha akara NIN. Mana Tomiwa Olatunji, nwa akwụkwọ BBC Igbo gbara ajụjụọnụ n'ụlọrụ NIMC,Oshodi kwuru na o nweghị onye nara ya aka azụ. Olatunji onye kwuru na ya debanyere aha ya ụbọchị Tọzde ma nweta akara ahụ n'ụtụtụ Fraide sị, ""Naanị nari naira abụọ bụ ihe a nara m."" Ozi ụlọọrụ bipụtara n'igwe okwu Twitter sị ụlọọrụ ha bụ na ""ndebanye aha bụ n'efu,"" ma kpoo oku ka onye ọbụla a nara ego wetara ha ozi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44409692,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44409692,Okwu mgbape ụzọ Chimamanda kwuru etinyela ọkụ na soshal midia,Okwu na-ewu na Twitter tata bụ okwu banyere mkparịtaụka Chimamanda Adichie na onye ọkpaọchị ama ama bụ Trevor Noah nwere ụnyaahụ.,"Adichie bụ onye na-agba mbo ihu na nwoke na nwaanyị nọ nhatanha Na mkprịtaụka ahụ, Adichie sara ajụjụ Noah jụrụ ya banyere nwoke imepere nwaanyi ụzọ. Azịza ya metụtara okwu ihe ụmụnwoke na-eme ma ha hụ ụmụnwaanyị nke bụ imepere ha ụzọ. Chimamanda kwuru na na agbanyeghị na ya akpọghị nwoke igbapere ya ụzọ asị, ọ naghị amasi ya ma ha mee ihe a makana ọ bụ nwaanyị. Ọ sị na ya na-emepere nwoke ụzọ, nwoke na-emepekwara ya. Mana okwu ya bụzị ihe ndị mmadụ nwere etu ọzọ na soshal midia dịka ọtụtụ ndị mmadụ bidoro na-akpọlị ya, sị na okwu ya adabaghị. Kayode Ogundamisi, bụ onye ama ama na Twitter so na ndị buu ụzọ tinye ọnụ n'okwu mgbe o dere na Adichie na-akpọ ụmụwaanyi nwoke na-agbapere ụzọ bụ ndị ike adịghị. Ositadimma Izuchukwu Anslem na Facebook dere na Adichie ekopula n'uche ya. Ka onye ji akara Twitter @GeniusJokerNG kpara ụka ọchị were sị na ya na-eche mgbe Adịchie ga-etinye ọnụ na okwu umụnwoke inye umunwaanyị ego bụ mgbe ya ga-abụrụ onye nkwado ya. Mana, o nwere ndị kwenyere n'ihe Adichie kwuru ma kwuo na ndị mmadụ aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. Onye nwere akara @ItsOreoluwa so na ndi uche ha di otu a. Onye edemede ama ama bụ Chika Unigwe, dere n'akara Twitter ya na ndị mmadu kwesiri imata na Adichie bụ otu onye, ma bụkwara onye adịghị asi ka ndị mmadụ hụ ya n'anya. O kwukwara na Adichie bụ na-ewetera Naịjirịa ihe. Gimba Kakanda, bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere Naịjirịa tinyere ọnụ were sị na ndị mmadụ na-akpụ aha Adichie n'ọnụ. Ma kwuo na onweghị onye o kwesiri i nara ikike tupu o kwuo okwu. Okwu a ka na-adakwa ụda na soshal midia. Nke mere ụfo jiri na-ajụ ka ọ bụ na ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ ịghọtaghị ihe Adichie na-ekwu mgbe ọbụla. Amaghị Chimamanda Adichie ka onye na-asa okwu ndị mmadu kwuru maka ya na soshal midia. Ma ruo ugbua, o nwebeghị ihe o kwuru, mana nwanne ya nwoke kere ihe nkiri ebe ọ nọ kwuo okwu a, ka ndị mmadu nwe ohere ihu etu osiri da ya n'ọnụ." afirika-54919733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54919733,Pfizer Covid Vaccine: Mba UK enyela ikike ka a malite ịgba ndị mmadụ ọgwụmgbochi a,Mba UK abụrụla mba mbụ n'ụwa niile kwetara ka e jiri ọgwụ Pfizer/BioNTech maka mgbochi ọrịa coronavirus.,"Onye a na-agba ọgwụ nnwale maka coronavirus Ngalaba ahụike mba ahụ enyela ikike ka amalite ịgba ọgwụ ahụ n'izuụka na-abịa abịa. Nnyocha gosiri na ọgwụmgbochi ahụ nke ụlọọrụ Pfizer/BioNTech rụpụtara na-arụ ọrụ karịa pasentị iri itoolu (%90). A ga-amalite ịgba ya na mpaghara mba UK ebe ọnụọgụgụ ndị nwere coronavirus karịrị akarị. Mba UK azụtala ọgwụ ahụ ihe ruru nde iri anọ (40 million) nke ga-ezu ịgba mmadụ nde iri abụọ (20 million), n'ihi na a na-agba otu onye ọnụ ọgwụ abụọ. Ihe ị kwesịrị ịma banyere ọgwụ mgbochi a Ọgwụ mgbochicoronavirus ọzọ a kpọrọ 'Moderna'nke ikike ya ruru pasentị 95 Ị nụkwala maka ọgwụ mgbochi coronavirus ọzọ nke ikike o ji egbochi covid-19 e ruola pasenti iri itoolu na ise (95%)? Nke a si na data ndị ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ bụ Moderna dị n'Amerịka. Moderna na-esochi ụkwụ ọgwụ mgbochi nke ụlọọrụ Pfizer, nke na-enye ndị mmadụ nkasiobi na ọgwụ mgbochi a nwereike inye aka kwatuo ọrịa ozuruụwaọnụ bụ Coronavirus. Ụlọọrụ abụọ ndịa jiri ụzọ ọgbara ọhụrụ puruiche emepụta ọgwụ mgbochi ha. Moderna sị na ha na-eche mbinyeaka ka ọgwụ mgbochi ha n'izu ole na ole na-abịa. Mana nke a gosiri na asabeghị ọtụtụ ajụjụ ụfọdụ maka ọgwụ mgbochi a. Ọ ga-adị mma? Coronavirus: Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara ọrịa a Mmadụ karịrị puku 30 n'Amerịka nwara ya ebe mmadụ puku 15 bụ ndị e nyere doz abụọ ya n'izu anọ. Mmadụ 11 bu coronavirus ebe ọ dị ukwuu mana o metutaghị ndị mmadụ gbara ọgwụ mgbochi a. ""Etu ọgwụ a si akpa ike dị egwu... ọ bụ oke ụbọchị,"" Tal Zaks, onyeisi ọrụ ahụike na Moderna, gwara BBC. Coronavirus Tips: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus? Dọkịta Stephen Hoge, onyeisi ụlọọrụ a, kwuru na ""o gere ntị ọfụma"" dịka ka mpụtara nnyocha gbara n'anwụ. Ọ gwara BBC: ""Echeghi m na o nwere onye n'ime anyị bu n'obi na ọgwụ a ga-akpa ike n'igbochi ọrịa covid-19, ọ bụ nchọpụta na-atụ n'anya."" Kedụ mgbe ọ ga-erute m aka? Mba UK ewepụtala atụmatụ ga-ahụ na e bu ụzọ nye ndị kachasị kaa nka ọgwụ mgbochi. Kedụ ihe anyị na-amaghị Anyị amaghị ogologe oge ole ọgwụ a nwereike igbochi ọrịa n'ahụ mmadụ, a ga na-eso ndị a gbarala ya ruo oge ga-adị anya iji saa ajụjụ a. E nwere kepukepu na ọ na-echekwa ndị katara nka, bụkwanụ ndị nwereike ịnwụ site n'ọrịa covid, mana ozi a ezuchabeghi. Maazị Zaks gwara BBC na nnyocha gosiri na afọ ole mmadụ dị ""anaghị eme ka ikike ọgwụ a daa."" A maghị ma ọgwụ a ọ na-akwụsị mmadụ ịrịa oke ọrịa, maọbụ kwụsị ha ikesasị nje ya. Ajụjụ niile a ga-emetụta etu e si aṅụ ọgwụmgbochi coronavirus. E nwere ọghọm dị na ya? E nweghi ihe ịtụ egwu ọbụla pụtara ihe a hụtarala mana o nweghi ihe ọbụla bụ ọgwọọ kpamkpam, gụnyere ọgwụ paracetamol. Obere ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na ahụ mgbu bụ ndị a hụtara n'ahụ ụfọdụ mmadụ oge a gbachara ha ọgwụ a. ""Ha bụ ihe a na-atụ anya n'ọgwụ mgbochi na-arụ ọrụ ma e tinyere ya ụdị ahụ nwere ikike ibuso ọrịa agha"" Ọkammụta Peter Openshaw, nke Mahadum Imperial dị na Lọndọn kwuru." afirika-50631291,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50631291,Ipob Anambra clash: Gọọmentị Anambra ekwubeghị pịm banyere ọgbaghara a,Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara Ifite Ọraifite ebe ihe mere kọwara etu mmadụ jiri kọọ n'Ọraifite.,"Ọ sị na ndị ọ hụrụ na-atụ ụjọ ịgwa anyị n'ihe onyoonyo ka ihu ha gosi, ebe niile dịka ha na-agba ọsọ agha. Ahịa, okpororo ụzọ tọgbọrọ chakoo. Ndị Ọraifite dọrọ onye ntakụkọ anyị aka na ntị ka o mee ọsịịsọ gbapụ ebe ahụ maka etu obodo dị. Ndị uweojii nyere aha ndị otu ha nwụrụ dịka Maazị Joseph Akubo, onye ji ọkwa"" Assistant superintendent"" na Maazị Oliver Abbey, onye bụ onyeisi uweojii na-achịkọta Ọraifite. Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo akatọọla njem ahụ ndị uweojii gara n'Orifite maka oku agbara ụlọ ndị mmadụ nakwa ndị egburu mgbe ha gara ijide ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor. Ọ kpọrọ oku a n'Enugwu ụnyahụ ebe ọ sị ka ehibe ụlọikpe pụrụiche ga-elebe anya na ya bụ okwu bụ nke ọ sị na ọ nweghị ezigbo ihe mere ebe ahụ ndị uweojii ga-eji kpaa ụdị agwa ha kpara ebe ahụ. Ndi otu Ipob na-ekwukwa na egburu ndị otu ha. Nwodo sị na ọ dịghị mma ndị uweojii ịbute ọgbaghara n'obodo ebe ọ bụ na ọ bụ otu onye, Ifeanyi Ejiofor ka ha chọtara. Ndị otu Ipob agọọla aka ha na ụkwụ ha n'ebubo ndị uweojii Anambra steeti bọrọ ha na ha gburu ndị uweojii abụọ n'Ọrafite, Anambara steeti. N'akwụkwọ ozi ha wepụtara, nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powereful binyere aka, Ipob kwuru na ọ bụghị ha gburu ndị uweojii a na-ebo ha n'ebubo. Ha boro ebubo na ndị uweojii wakporo ụlọ ọkaiwu onye ndu ha bụ Ifeanyị Ejiofor abali anọ ọ kwachara nwanwe ya nwoke, gbaa ụlọ ya ọkụ iji maja ya n'ikpe Kanu ga-abịa n'ọwa ọzọ. Ha sịrị: ""Nke bụ bụ eziokwu bụ na ndị uweojii na ndị agha gara n'ụlọ ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ..."" ""Oge ha rutere, ha bido gbawa ndị mmadụ enweghị ngwaọgụ ọbụla ha ji egbe, ha gbagburu ụmụnwoke abụọ si n'ụlọ ya pụta, buru ozu ha tụnye n'ụgbọala ha mapụọ iji gbochie ihe aka ebe."" ""Ha wụkwara mmanụ ụgbọala n'ụlọ Ejiofor ma sunye ya ọkụ."" Ihe ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor kwuru maka ihe mere Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ebe ọ na-ekwu na ndị uweojii emeela ya onye enweghị ebe obibi. Onyeisi ndị uweojii na Anambra steeti bụ John Abang arịọla ọha ka ha chọta ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na ndị otu ya. Otu onye wenitere isi n'Oraifite na achọghị ka akpọpụta aha ya ekwuola na ndị otu Ifeanyi Ejiofor gụnyere ụfọdụ ndị otu Ipob nakwa otu nzuzo akpọro 'otu Eke' gburu ndị uweojii abụọ . O kwuru na ọsọ ka na-agba n'Oraifite ruo ugbua maka ya bụ ọdachị. Oraifite Killing: Ndị mmadụ ka na-agba ọsọ ndụ ha n'Obodo ahụ - Anya hụrụ ihe merenụ O kwuru na ọdachị metụtara ahịa nkwọ zụrụ ụnyahụ makana onye ọbụla riri mbombo ọsọ ruo ugbua. O kwuru na ọkaiwu Ejiofor na ndị otu ya agbafuchala. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed sị na ndị ha na-eche na ha bụ ndị Ipob wakporo ma gbuo ndị otu ha abụọ gara ịkpụta Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na be ya dị n'Oraifite di n'okpuru ọchịchị Ekwusigo n'Anambara steetị. Dịka Maazi Haruna siri kwuo, ha gara be Ọkaiwu Ejiofor maka mkpesa n'aka dị na mmebi ihe na ntọrị mmadụ. Ifeanyi Ejiofor bu ọkaiwu onyeisi otu akpọrọ na Bekee ""Indigenous Peoples of Biafra"" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu. Haruna sị ""Ọ bụ onyeisi ndi uweojii n'Oraifite bụ Oliver Abbey du ndị uweojii ga na be Ifeanyi Ejiofor."" O kwukwara na ""Ka he ruru ebe ahụ ndị echere na ha bụ ndị Ipob wakporo ha ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha, merụọ ụfọdụ ahụ. Ha gbakwara ụgbọala ndị uweojii ọkụ."" Ifeanyi Ejiofor mechara akwamozu nwannw ya nwoke n'ụbọchị Satọde na be ya. Nnamdi Kanu n'owe ya si na ọ bụ ndị""Ezinaụlọ Ipob"" ka egburu n'ụtụtụ Monde. Ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ụlọ ndị gbara ọkụ n'ime onyoyo na-ekwu na ọ bụ be na agbataobi Ejiofor ka ọkụ a na-ere. BBC Igbo jụkwara Mohammed maka ya bụ ọkụ mana ọ sị na ya amaghị maka nke ahụ. N'gbanyeghi nke a, ọ sị na ndi uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ agbachiela Oraifite iji jide ndị ọ si kpara mkpa mkpa a. Ụgbọala Ipob gbara ọkụ na ahịa Nnewi n'afọ 2018 ""Anyị anwụchiela ụfọdụ n'ime ndị mere ihe ka na-achọkwa ndi ọzọ."" BBC Igbo gbara mbọ inwete Ọkaiwu Ejiofor n'ekwentị ya mana ọ mịtaghị mkpụrụ. BBC Igbo kpokwara ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful mana ọsaghị mgbe ekwentị ya kpọrọ. Ka ọ ọkwụ ugbua, ozi na-eru BBC Igbo nti site Oraifite na-akọwa na ebe niile dịzi ka ebe agbara ọsọ agha. Nke a abụghị mbụ ndị nchekwa na ndị Ipob ọrụ nchekwa ka eko isi na nso a, dịka akukọ pụtara na mgbọ tụrụ ndị mmadụ mgbe ndi uweojii gara itisa ebe ndị Ipob na-eme ọgbakọ n'Ebonyi steeti. Cheta na gọọmenti Naịjirịa akpụtala kwuo na Ipob bụ otu oyi egwu, bụ atụmatụ ụlọikpe kwenyekwara. Atụmatụ a nyere ha ikike ịmachi iso maọbụ ime emume dika Ipob na Naịjirịa. Ifeanyi Ejiofor nọ n'isi ndi na-agba ụlọikpe ịhụ na ewezụgara ya bu atụmatu gụnyere Ipob n'ime ndi oyi ndụ egwu." afirika-49137409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49137409,Igbo Ancestry: Lee ndị Amerịka chọpụtarala na ha bụ ndị Igbo,"Nke Igbo mere ọkacha mma? I lee anya, i ga-achọpụta na ebe ọbụla ihe na-aga nke ọma, aka onye Igbo na-adịkarị ya.","Maka etu ndị Igbo na-esi emekarị njem dịka ndị mbịarambịara, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ na ndị Igbo mụrụ nwa na mba dị iche iche. Ka ọtutu afọ gachara, ọtutu n'ime ndị a amụrụ na mba ọzọ ọtụtụ afọ gara aga, amalitela iji teknụzụ na sayensị wee chọpụta na ha bụ ndị Igbo site na inyocha ihe a kpọrọ 'DNA' ha. BBC Igbo na-atụle mmadu abụọ a so n'osisi ka osisi ma a bịa na mba Amerịka. Mmadụ abụọ a egosikwala n'ezie na ha bụ ezi ụmụafọ Igbo n'ihi na ha na-eme ọfụma n'akaọrụ ha dị iche iche. T.D Jakes TD Jakes bụ onyendu ụka Kraist nke nwe ụlọụka a kpọrọ 'Potters House' ma bụrụkwa onye na-emeputa ihe onyonyo ama ama n'ụwa nille gburugburu. TD Jakes bidoro ịka ụka dịka onyendu mgbe ọ dị naanị afọ iri abụọ na atọ n'afọ 1980. Kama, ọtụtụ mmadụ amaghị na ndị nnanna nwoke a bụ ndị Igbo, nke mere ka ọ bụrụ nwaafọ Igbo. O kwuru na ndị Igbo bụ ndị a na-akpọ ""Black Jews"" ma kwuokwa na ndị Igbo bụ ndị na-agba mbọ. Lee ihe onyeisioche n'ahu maka ndị Naijirịa nọ n'ofesi kwuru maka nkea: Forest Whitaker Forest Whitaker na-enyere ụmụaka ndị agha metụtara na mba Uganda aka. Forest Whitaker bụ onye na-eme ejije na mba Amerịka nke a ma dịka ""Hollywood"". Forest bidoro ime ejije n'afọ 1982. Echiri ya echichi ""Nwannedinamba"" nke Nkwerre Imo steeti. O mere nyocha 'DNA' were chọpụta na nnanna ya bụ onye Igbo. Olaudah Equiano "" A bụ m onye eluigwe hụru n'anya"" Olauda Equiano Olauda Equiano bụ onye Igbo ndị ntọ tọọrọ n'obodo Isieke nke dị n'Imo steeti mgbe ọ dị afọ iri na otu. Ndị ntọ a tinyere ya n'ụgbọmmiri nke buru ya gaa obodo Barbados. Otu nwoke onyeocha bụ Micheal Pascal zụtara ya dịka ohu were nye ya aha Gustavus Vassa n'afọ 1754. Micheal kuziere ya etu esi akpọ ugbọ were mechaa ziga ya obodo Briten ka nwunye nwanne ya guziere ya akwụkwọ. E mechara, Robert King onye Amerịka were gote ya. Robert King kwere ya nkwa na ọ ga enwere onwe ya ma ọ kwụọ ya Pọm iri anọ (nhata ya bụ Pom 5,400 n' 2018) n'afọ 1756. Olauda kwuru ugwu a were nwere onwe ya n'afọ 1766. Olauda Equiano dere akwụkwo ya ama ama nke ọ kporọ "" The Interesting Narrative of The Life of OLauda Equiano, or Gustavus Vassa, the African"" n'afọ 1789. Akwụkwọ a kọwara ihe niile gbasara ndụ ya. Olauda lụrụ nwanyị onyeocha, ha mụtara ụmụnwanyị abụọ. Olauda nwụrụ n'afọ 1797. Ọtụtụ ndị ọzọ dịkwa ka mmadụ abụọ a achọpụtala na ha gbara mgbọrọgwụ n'ala Igbo. N'otu n'otu, ha ga na-agbakwa onwe ha n'anwụ. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị: Obyno Daddy Muna Nke a ga-amasịkwa gị: The Experience 13: Lee ka Don Moen na otiegwu ndị ọzọ na-asụ Igbo" afirika-45644106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45644106,Lee ụdịrị ihe ndị e ji eme nturugo na mahadum Naịjirịa,"O nwere ihe o mere ma e nye ndị mere ọfụma na mahadum ihe nrite dịka ji, ewu, ọkụkọ na ego na-enweghi ebe o ruru eru?","E nyere nwata akwụkwọ a Ji na ọkụkọ maka ịbụ onye kachasị mara akwụkwọ n'otu ya na mahadum Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-ewe iwe sị ""gịnị kpatara a ga-eji nye ndị kachasị mara akwụkwọ na mahadum obere ego, ma bunye ndị mere ihe nkiri dịka ""Big Brother"" nnukwu ego nde kwụrụ nde? Ụfọdụ ndị Naịjirịa kwuru na ha aghọtaghị ihe mere a ga-eji na-enye ndị na-aga asọmpi ndị dịka nke a na-agụ egwu, ihe nkiri nakwa ihe ndị ọzọ ọtụtụ ego. Ha kwuru na ha amaghị ihe mere a ga-eji nye ndị mere ọfụma n'ihe gbasara ịgụ akwụkwọ ihe ndị na-enweghi ebe o ruru eru. Ihe e nyere ndị mere ọfụma n'akwụkwọ Ezinne Okeke bụ onye nwetara ji nakwa iko agwa ole na ole kwuru na obi dị ya aṅụrị. Onye ọzọ bụ @ty_Fregz kwuru na e nyere onye ya na ya gụkọrọ akwụkwọ bụ Omubo Joy naanị narị naịra abụọ na iri ise (N250). Akụkọ kwukwara na onye kachasị mee ọfụma na mahadum Ọshụn steeti n'afọ 2016 nwetara naanị iko. @DirectorSolomon tinyere na Twitter na onye kachasị mee ọfụma na 'Medicine and Surgery' na mahadum Nsukka nwetara naanị puku naịra iri (N10,000). @TrendsOfNigeria kwuru na onye ọzọ bụ Chinelo Okafor nwetara puku naịra iri abụọ na isii (N26,000) oge nke ya. Nke @Pius_Ojemolon dị ka ọ kacha njọ, makana o kwuru na o nwetebeghi ego niile ekwere ya na nkwa ka otu afọ na ọnwa ise gachara kemgbe ọ pụtara dịka onye kachasị mee ọfụma na mahadum ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53664424,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53664424,Ammonium Nitrate: Ihe ọ bụ nakwa etu o si ememina mmadụ,Mba Lebanon ka na-eru uju dịka oke ọkụ gbachara n'isi obodo mba ahụ bụ Beirut gbuo mmadụ kaịrị 100 ma merụọ mmadụ kaịrị puku anọ ahụ (4000) n'ụbọchị Tusde.,"Obodo Beirut niile mara jiji maka oke ọkụ ahụ malitere n'ọdọụgbọmmiri tupu ọ gbawa ka ogbunigwe. Onyeisiala mba ahụ bụ Michel Aoun kwuru na ọ bụ ammonium nitrate ruru tonne 2,750 a na-edozighị ọfụma kamgbe afọ isii n'ụlọ a na-edowe ngwongwo butere ya bụ mgbawa ọkụ. Gịnị bụ ammonium nitrate? E nwere ọtụtụ ihe e ji ammonium nitrate eme, mana ihe abụọ a kachasị e ji ya eme bụ iji ya wulite ihe akọrọ n'ugbo ma bụrụkwa ihe mgbawa. Ọ na-aka agbawa ma ya na ọkụ jekọọ, ọ gbawa o wepụta gasị jọgburu onwe ya a na-akpọ nitrogen oxides nakwa ammonia. ""Now I'm shaking, all the way from up to down"" - Eyewitnesses describe the power of the explosion Maka etu o si agbawa, enwere usoro dị oke mkpa eji edowe ya: Nke mbụ bụ ị ga-edowe ebe ọkụ agaghị agbali ya, agaghị enwe ihe dịka ọwa mmiri maọbụ paip dị n'akụkụ ya makana ihe ndị a nwereike ibute ọkụ mgbawa di egwu. Akụkọ na-ekwu na 2,750 tonnes a edozighị ọfụma na Beirut bụ nke otu onye tụbatara na mba ahụ n'afọ 2014 mana gọọmenti Lebanon jichiri ya, ma bido inyocha nkwa kpụpụ onye ahụ n'ụlọikpe. Okwu ka dị n'ụlọikpe tupu ọkụ ọgbụgba a eme. Ammonium nitrate na nke nke Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54078928,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54078928,Adult Bedwetting: Lee enyemaka maka ndị okenye na-aba mamịrị n'elu akwa,Ịba mamịrị n'elu akwa bụ otu ọrịa ndị mmadụ na-eche ndị mmadụ ọ metụtara echiche dị ukwu.,"Mana ihe ihere so ya anaghị ekwe ndị mmadụ pụta jụọ ase maọbụ nata ọgwụgwa maka ya. Ihe ọzọ sokwa bụ maka etu e si ahụta ndị ọrịa a na-arịa n'obodo site n'ileda ha anya maọbụ ịkparị ha. Anyị jụrụ otu dọkịnta aha ya bụ Henry Eze nke kọọrọ anyị ihe na-akpata ọrịa a, etụ ị ga-esi nyere onwe gị aka nakwa ihe ndị ịkwesighị ime. Lee ihe ọ gwara anyị na mpe mpe ya. Ihe ndị na-eme ka mmadụ baa onwe mamịrị n'akwa gụnyere ihe ndị a Ọrịa akpa mamịrị Ị ba mamịrị n'elu akwa nwereike ịbido site n'ọrịa akpọrọ ""Uniary Tract Infection' maọbụ ọrịa ọbụla metụtara akpa mamịrị ọbụla. O kwukwara na ọ na-arara ndị ahụ ahụ ị jidete mamịrị ha ma n'ehihie mgbe ha mụ anya. Mmerụ ahụ n'ọkpụkpụ azụ Ihe ọzọ na-ebute ya bụ mmerụ ahụ metụtara ọkpụkpụ azụ nke Bekee kpọrọ ""Spine"". Nke so ya bụ ọrịa kansa si ebe ọzọ n'ahụ gbasaa rukwe n'ọkpụkpụ ahụ. Mmegbu maọbụ mmerụ ahụ n'ụbụrụ isi Ndị gabigara ahụhụ, mmegbu maọbụ ndị merụrụ ahụ n'uburu so agabiga ịnyụ mamịrị n'akwa. Ọ na-emekarị mgbe ha banyere n'ọnọdụ Bekee kpọrọ ""catatonic"" nke pụtara na echiche ha ga-alaghachi dịka mgbe ha dị n'ụmụaka. Ọ pụtara na ha ga na-aba mamịrị dịka ụmụaka. Ndị na-aṅụ ọgwụ ike na mmanya ike Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka, na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara maka 'kpoli ndụ' O kwuru na ndị okenye na-aṅụ ọgwụ ike nwereike ị na-aba mamịrị n'akwa maọbụrụ na ha ṅụchaa ya bụ ọgwụ O kwukwara na ndị na-aṅụ mmanya ọkụ nwereike ịba mamịrị n'elu akwa maọbụrụ na ha akpachaghị anya. Ihe ndị ịkwesighị ime ndị na-agabiga ihe a - Akwụsịla ha ịṅụ mmiri n'ihi na ịchọrọ ịbelata mamịrị n'akwa kama ṅụọ mmiri ịkwesiri n'ụtụtụ nakwa ehihie - Mamịrị na-akpa ha, ha nyụọ ya ozugbo ozugbo kama ijide ya. - Akpọla ha aha ọjọọ maọbụ tie ha ihe iji mee ka ha kwụsị ya. Eze kọwara na ịnye ndị a nkwado ga-enyere ha aka nwee obi siri ike na ha ga-akwụsịnwu ya bụ ihe. Etu ị ga-esi nyere onwe gị aka Nwaanyí na-ehi úra Ihe mbụ Dọkịnta Eze kwuru bụ ka onye ọbụla ihe a na-eme gaa hụ dọkịnta ha n'ihi na o nweghi ihere dị na ya. Ihe ọzọ ịnwereike ịme bụ" afirika-49497170,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49497170,Parliament: Ihe ịkwụsị ụlọomeiwu mba Briten n'ike pụtara,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth nke abụọ, enyela ntụziaka ka a kwụsịtụ ụlọomeiwu mba ahụ ọrụ.","Nke a na-eme dịka Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kpọrọ Ezenwaanyị Elizabeth oku ka o mee nke a. Ụlọomeiwu mba ahụ ga-akwụsị ọrụ abalị ole na ole ọ fọrọ tupu ndị omeiwu ebido ọrụ n'ọnwa Septemba. Ihe nke a pụtara bụ na ndị ụlọomeiwu mba ahụ agaghị enwe ike ịkpakọrịta maka mpụta mba Briten n'otu European Union na enweghị nkwekọrịta ọbụla n'abalị 31 nke ọnwa Ọktoba. Ọtụtụ ndị nwere agba na mba ahụ akaatọọla ya bụ atụmatụ n'ihi na ha kwuru na o megidere igbaso usoro ọchịchị onyekwuouche ya n'okwu mba Briten ịpụ n'otu European Union nke a ma dịka 'Brexit' n'aha ịchafụ. Onyeisi ụlọomeiwu mba Briten bụ John Bercow, kwuru na nke a bụ ""ome megide iwu"" ""Etu ọbụla e siri lee ya anya, ihe mere e jiri kwụsị ụlọomeiwu ọrụ bụ iji gbalahụ ndị omeiwu itinye ọnụ n'okwu gbasara 'Brexit' nakwa ịrụ ọrụ iso hazie ogboro mba anyị na-agbaso."" Jeremy Corby sị, ""ịkwụsị ụlọomeiwu ọrụ n'ike bụ ihe a gaghị anabata."" ""Nke a bụ ihe ọjọọ megidere ọchịchị onyekwuouche ya nakwa ikike dịịrị ndị omeiwu."" Onye ndu pati Labour bụ Jeremy Corbyn kwuru na "" ịkwụsị ụlọomeiwu ọrụ n'ike bụ ihe a gaghị anabata. Ihe Praịm Mịnịsta mere bụ tigbuo-zọgbuo nweta mkpebi 'no-deal'"" Ihe 'no-deal' pụtara n'okwu Brexit bụ na mba Briten ga-ahapụ otu European Union na-enweghị nkwekọrịta otu ha ga-esi gbaso. Ọ pụtakwara na Briten ga-apụta ozugbo n'otu ọbụla o sonyeburu na ya dịka Ụlọikpe Ukwu nke European Union (European Court of Justice), nke nchekwa (Europol) nakwa otu ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru 12. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44064498,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44064498,Ndị uweojii akọwala ihe IGP ejighị za oku sịnetị kpọrọ ya,"Ebe ndị ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sineti na-ewe iwe ihe mere Ibrahim Idris jirị gba ha nkiti n'oku ha kpọrọ ya, ndị uweojii na-akọwa ihe mere.","Onyeisi isi ndị ụlọomeiwu sineti kwupụtara ụnyaa na Ibrahim bụ onye iro ọchịchị onye kwuo uche ya. Ha dere n'ụfọdụ ozi n'elu Twitter na Idris so onyeisiala mee njem ọrụ n'ụbọchị ha ziri ya ozi ya bịa ma na ọ gbara mbọ zi ga ndị nnọchịtere ya anya. Lee nkọwa ha ebe a: End of Twitter post, 1 Cheta na ndị ụlọọrụ sineti akpọkuola onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ugbo atọ mana Ibrahim abịaghị na onwe ya chacha, kama ọ na-ezite mmadụ. Mana ndị sineti chọrọ ịhụ ya onwe ya ka ha na-abụghị onye ọ na-ezite nke mere na ha kpọrọ Ibrahim onye iro megide ọchịchị onye kwuo uche ya, were kwukwaa na o kwesighi ịnọ n'oche ọchịchị ahụ. N'aka nke ya, onyeisiala ndị uweojii zaghachiri iwu ahụ ndị sineti tiri ma kwuo na ya emeghị ihe ọjọọ ọbụla ma ya adakwaghị iwu ọbụla. Ọ kọwara na osote ya bụ AIG ndị uweojii nwere ikike nke akwụkwọ nyere ịnọchite ya ebe ọbụla nakwa n'ihe ọbụla a na-eme, ya bụ na ọbụghị iwu na ọ bụ ya gara zaa oku ahụ n'onwe ya. Ndị sineti na-akpọ ya ka ọ bịa zaa ọnụ ya gbasara ihe na-eme otu onye n'ime ha bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye ndị uweojii nwụchiri. Ibrahim Idris na Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchite anya ndị Kogi West na-akwata ya maka ebubo mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchiri boro ya Mana o kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla maka ndị ụlọikpe kpebiri na Melaye adịla ike ịga ụlọikpe tupu ndị uweojii akpọrọ ya gawa Lokoja ebe a kpụpụrụ ya ụlọikpe. Ibrahim kwuru na ihe ndị sineti na-eme bụ iji mee ka agharị ikpe ikpe kwụ ọtọ. N'okwu ya, ""Ihe ndị sineti na-eme bụ ịta m amusu na ịkpacha anya chọ ịkwụsị ikpe ziri ezi"" n'ihi na ndị a na-enyocha bụ ndị omekome kpọrọ Melaye aha dịka onye so ha kpaa nkata ọjọọ ma jide ngwọagha ndị machibidoro iwu. N'akwụkwọ ụlọọrụ ndị uweojii dere, o kwuru na, ""Onyeisi ndị uweojii agaghị adara mbọ mmadụ ọbụla maọbụ otu onye maọbụ mmadụ abụọ na-agba ịhụ na e mebiri ikpe kwụ ọtọ. ""Nke a mere na ndị uweojii Naịjirịa enweghi onye ha ga-arịọ mgbaghara ọbụla maka na ha ana-ahụ na-akwalitere iwu Naịjirịa, ịgba mbọ na mmdụ niil rubere isii nye iwu obodo nke kas=chasị agbanyeghi ọnọdụ onye ahụ n'obodo."" Obi adịghị ndị sineti mma maka na otu onye n'ime ha bụ Dino Melaye na-agabiga mmegbu n'aka ndị uweojii nke kpatara ha ji akpọrọ onyeisi ndị uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara nsogbu Melaye mana o zigara mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50165889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50165889,World Polio Day: 'Taa ka Afrịka ga-esonye na mba enweghịzị Polio' - WHO,Otu na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekpebiela na ha na ndị otu ha ekpochapụla ọrịa polio ụdịrị nke atọ n'ụwa gbaa gburugburu.,"E nwere ụdịrị polio atọ nwere otu ụdịrị njirimara nke gụnyere 'ọkpantụnwụ' maọbụ ọnwụ. Ụdịrị polio a ka Bekee kpọrọ ""Type 1, 2 na 3"". Ndị ọrụ ahụike ndị a kwuru na e kpochapụla ụdịrị nke abụọ bụ ""Type 2"", afọ anọ gara aga. Ugbua ka ha kwuru na ụdịrị nke atọ ya bụ ""Type 3"" alakwuola. Mana ụdị nke mbụ ya bụ type 1, ka na-efegharị na mba Afụganịstan na Pakịstan. Ọ bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise ka ọrịa polio na-ejidekarị. WHO na-ekwu na otu n'ime ụmụaka dị narị abụọ nwere ọkpantụnwụ sịte n'ọrịa polio. Ọ bụrụ na ya bụ ọrịa ntụnwụ ọkpa metụtara akwara, onye ahụ nwere ike ịnwụ. Ọrịa mkpọnwụ ụkwụ enweghị ọgwụgwọ mana ọgwụ mgbochi nwereike igbochi ya kpam kpam. E memilaala ọrịa a ihe ruru pasentị 99 kemgbe 1988, nke bụ na ihe fọrọ otu agwụla agwu. WHO ekwuolarị na ekpochapularị ụdị nke abụọ ya bụ Type 2 kemgbe 2015 ya bụ afọ iri na isii ahụdebere mmụba nke ikpeazụ n'India. Ọ gwụbeghị o O ruola afọ isii a kwụsịrị ịhụ mmụba ụdịrị nke atọ a na Naịjirịa. Kemgbe ahụ, otu kpọrọ onwe ha ""Global Commission for the Certification of Poliomyelitis Eradication"" nke WHO nọ n'isi ya, malitere inyocha mmụba ya bụ ọrịa ịhụ na ọ laala kpamkpam. Onye nnọchite anya ndị WHO n'Afrika bụ Matshidiso Moeti, kwuru na ""ikpochapu ụdịrị nke atọ bụ Type 3 nke polio bụ oke nzọ ụkwụ, mana onye adala mba makana ọrụ ka dị n'ihu"". Nke a gosiri mkpa ọ dị ikesi nkwụcha ike chebiri ya bụ ọrịa maka ihe ntụmadị. Ọ rịọrọ mba niile ka ""ha tinye anya na mmiri ịchọpụta mgbe ya bụ orịa ripụtawara isi ọzọ ka ha nwee ike ibuso ya agha"". Ụdị nke mbụ ya bụ Type 1 ka na-agagharị naanị n'Afụganịstan na Pakistan. Mgbe ikpeazụ a hụrụ ya na Naịjriịa bụ n'afọ 2016. Moeti sị ""ọrụ a agwụbeghị, ọ gwụchaa ma ụdị nke mbụ ya bụ Type 1 alara kpam kpam n'ụwa, ma ụdị nke na-esi n'ọgwụ mgbochi apụta akpọrọ ""vaccine-derived polio virus."". Ụdị nke a na-apụtakarị ebe ọgwụ mgbochi ezughị oke maọbụ ebe inyi karịrị. Ụdị a ka dị na mba iri na abụọ a; Angola, Bene, Kamerun, Sentral Afrịkan Repọblik, Chaadị, Demokratic Repọblik nke Kongo, Etiyopia, Gana, Nijee, Naịjiria, Togo na Zambia. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Career Choice: Ọrụ Bekee na ịrụrụ onwe gị ọrụ, kedụ nke na-amasị gị?" afirika-51655772,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51655772,Stress: Ị ma na ịrụ oke ọrụ na-ezughi ike nwereike igbu gị?,"Ụfọdụ ọrụ anaghị enye ohere ezumike nke bụ na ndị na-arụ ya bụ ọrụ anaghị enwekarị ohere inweta onwe ha, afọ kwuru afọ.","Ọrụ ndị a gụnyere ọrụ ndị uweojii, ndị agha, ndị ọrụ ụgbọelụ na-eme njem, ọrụ ntaakụkọ, ndị ọrụ ahụike, ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ ụgbọala, ndị na-ere nri, ndị ọgbatumtum na-eme njem na ọrụ ndị ọzọ. E nweghi ezumike zuru oke n'ọrụ na-ebute ọtụtụ ihe dị iche iche n'ahụ mmadụ. Ọ bụghịkwa naanị ọrụ na-ebute mgbakasị ahụ bụ nke Bekee na-akpọ 'stress', mkpa ezinaụlọ, etu i si eri nri nakwa ọnọdụ ahụike gị nwekara ike itinye aka ụfọdụ oge. Ihe enweghi ezumike na-ebute Ọ na-ebutenwu ọbara mgbalielu, ọ na-emekwa ka shuga dị n'ọbara mmadụ rịa elu, ọ na-emekwa obi ịkụ kpum kpum. Ọ nwekwara ike ime ka mmadụ na-eri oke nri ọkachasị nke bu oke shuga, na-ese anwụrụ nakwa na-aṅụ oke mmanya, nke nwereike ime ka mmadụ buo oke ibu. Mgbe ụfọdụ ọ na-ebutekwa mgbakasị ahụ; ịma atụ, onye nkuzi na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ị na-enwe ahụmgbakasị ebe ụmụakwụkwọ ya nọ. Dọkịnta na-awa ahụ na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ichefu ngwaọrụ dị iche iche n'ime ahụ onye ọ wara ahụ, ebe nke na-adụ ntụtụ nwereike ịdụhie ya n'ihi ọma jijiji. Ị nwereike ịga n'akụkụ mmiri zuru obere ike, nara ikuku nakwa gere ezigbo ụda mmiri nakwa nụ olu ụmụnnụnụ Chineke kere Ọzọ bụ na n'ihe dị ka oge a na-agba Ekeresimesi maọbụ na-eme ụfọdụ emume ndị ọzọ, ndị ọkwọụgbọala anaghị enwekarị ohere izu ike n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-akacha akpata ego. Ụfọdụ n'ime ha na-agba ugboro ugboro ka ha nwee ike ịkpata nnukwu ego. Ụdịrị agwa ahụ na-ebutere ọtụtụ mbere okporoụzọ n'oge ahụ, n'ihi na ụfọdụ na-arahụ ụra ka ha na-akwọ ụgbọala. Ị nwereike ike ịga ebe naanị gị na ihe e kere eke nke a kpọrọ nature na Bekee, ga-anọ Ihe ndị ọrụ ahụike na-ekwu maka ezumike Nwaanyị riri amusu n'ihe gbasara ahụike ụbụrụisi bụ Pamela Udọka kwuru na enweghi ezumike zuru ezu nwereike ibute agwa ọjọọ dị iche iche. Ọ sị na ọ na-ebute ahụ mgbakasị n'ezinaụlọ, ụlọọrụ nakwa n'ọha. Udọka sị na ""ọ bụ ya mere e ji enye ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ oyibo ezumike ma a gụrụ gụrụ"". Ọ sị na enweghi ezumike zuru oke nwekwara ike ibute ọrịa ụbụrụisi dị iche iche. Pamela Udọka sị na-enweghi ezumike nwereike ibute ọrịa ụbụrụ dị iche iche O kwukwara na mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike ịmerụ onwe ya ahụ maọbụ merụọ ndị ọzọ ahụ maka ọrịa ụbụrụisi so na ihe enweghi ezumike na-ebute. Udọka dụrụ ọdụ ka onye ọbụla gbaa mbọ wepụta oge maka ezumike n'ọrụ. O kwukwara na ịrahụ ụra zuru oke bụ ihe kacha mkpa n'ezumike. Ndị ọkammụta kwuru na ịrahụ ụra ihe ruru awa asaa n'ụbọchị dị oke mkpa. Ha kwukwara na onye ọbụla chọrọ ezumike kwesịrị inwe oge ha ga-eji wetuo ekwentị ya n'akụkụ, ọkachasị mgbe ọ chọrọ ịrahụ ụra. Onye ahụ kwesịrị ịkpọ ya mkpa ịhụ na o wepụtara oge ọ ga-eji na-alaba ụra kwa ụbọchị; ọ bụ n'ụtụtụ o, maọbụ n'abalị. O kwukwara na ụlọọrụ ọbụla na-anaghị enye ndị ọrụ ha oge ezumike bụ nke Bekee kpọrọ 'leave', na-agba onwe ha egbe n'ụkwụ. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Fertility in women: 'A na-akpọ m osisi amịghị mkpụrụ'- Nwaanyị chọgoro nwa ọtụtụ afo Akụkọ ga-amasị gị:" media-49109178,https://www.bbc.com/igbo/media-49109178,Ifeanyị Okowa: Kwụghachi ụgwọ ị nara ụmụakwụkwọ n'ụzọ ezighi ezi,Gọọmentị Delta steeti agwaala otu onyeisi ụlọakwụkwọ Teknikal na steeti ahụ ya kwụghachị ego ruru nde iri na otu bụ nke ọ natara ụmụ akwụkwọ n'ụzọ ezighi ezi.,"Ha jikwa ohere ahụ dọọ ndị isi ụlọakwụkwọ ndị ọzọ aka na ntị maka ịnata ụmụakwụkwkọ ụgwọ akwụkwọ ekwesighi ekwesi. Ide mmiri kpara ike n'Abuja End of Twitter post, 1 Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ebe ide mmiri batara n'ime ọdọụgbọelu Abuja. Ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na nke a mere ka ụfọdụ ụgbọelụ gaa Kano iche ka ya bụ mmiri zochaa tupu ha efebata. Super Eagles ana-achịkwanụ? Ọkwa otu Naịjirịa arịala dịka ha ritere ọla nchara na nwgụcha asọmpị iko mba Afịrka afọ 2019 Otu Super Eagles n'ọzị n'ọnọdụ iri atọ na atọ dịka ha gbagoro ọnọdụ iri n'abụọ. Gee Nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Onyeisiala Tụnịshịa anwụọla A kpọ Beji Caid Essebsi gawa ulọ ọgwụ n'abalị Wenesde Onye bu onye mbụ banyere ọchịchị na Tụnịshịa bụ Beji Caid Essebsi anwụọla n'afọ 92, dịka gọọmentị mba ahụ siri kwuo. Maazị Essebsi bụbụ onyeisiala tọchasịrị n'ụwa. Ọ gara ulọogwụ ụbọchị Wenesde mana ndị ọrụ ya ekwughi ihe ọ na-arịa. O meriri ntulikaka mbọ emere n'usoro onye kwuo uche ya na'afo 2014. Na mbido afọ a, o kwuru ya agaghị apụta ịzọ ọchịchị na ntuliaka a ga-eme n'afọ. N-Power achụọla ndị mmadụ n'ọrụ Akuko na-eru anyị ntị sị na Gọọmenti Naịjirịa achụọla ihe ruru mmadụ pụkụ abụọ ndị ewere na N-Power bụ ihe ehibere maka ịnyere ndị enweghị ọrụ aka. Justice Bibiye bụ ọnụ na-ekwuru N-power sị na ha chọpụtara na ndị ahụ ejighị ya bụ ọrụ kpọro ihe. Magu na ikpe Diezani Magu kọwaputara ego ya ndị otu ya chọputara na arọ gara aga na Vienna. Onye nọgodi n'isi ụlọọrụ EFCC bụ Ibrahim Magu etiela mkpu maka oge ọ na-ewe ịkpebi ikpe Diezani Allison Madueke na mba Briten. Magu tiri mkpu a mgbe ndị isi Interpol na mba Briten biakwutere ya n'ụlọọrụ ya n'Abuja bụ ebe ọ nọ kwuo na ya bụ ikpe nwaanyị eboro ebubo mpụ eruola afọ anọ ugbua. Mueller agọnahụla Trump Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ofesi, Robert Mueller agọọla na onweghị mgbe ya ji kwuo na aka Donald Trump bụ ọnyesisala mba Amerịka kwụ ọtọ na nchọpụta ya mere. Mueller bụ onye nọ n'isi nyocha maka ebubo na Russia na Trump kpara mkpa mkpa na ntuliaka ha mere na 2016. Fifa agbaala Musa Bility butu Nchọpụta emere na LFA gosiri na Musa Bility na-enye onwe ya ọrụ. N'egwuregwu, Fifa amachiela onyenchikọta egwuregwu mba Liberia bụ Musa Bility afọ iri maka ego ha sị na o riri. Bility sị na aka ya dị ọcha na ọ bụ amoosu ka ha na-ata ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Johanesburg: ""A chụrụm n'ọrụ mana a bụzịm onye na-enye ọrụ na South Africa""" afirika-43962708,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962708,A ga-akpọ Fulani ọchịehi 'oyiegwu'?,Mkpamkpa a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi emela ka ọtụtụ ndị mmadụ jụọ ihe mere ejịghị kpọ ha ndị 'oyiegwu.',"Onwere ndị Fulani na-achị ehi bu egbe ukwu agagharị Cheta na arụ dị icheiche, dịka ogbugbu mmadụ na ịgba akụnaụba ọkụ na-akpa na Benue, Zamfara, Taraba nakwa steetị ndị ọzọ na Naịjirịa bụzi ihe a na-akọ ụbọchị niile na Naịjirịa. Ndị gọọmentị kwuru na nsogbu a sitere na esemokwu dị n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụugbo, mana ndị mmadụ na-akọwa na ihe bụ mkpamkpa ndị Fulani na-achị ehi na-akpa iji chụpụ ndị mmadụ n'ala nna ha nyere ha. Otu onye kwenyere siri ike na ndị Fulani na-achị ehi nwere atụmatụ a bụ Sịnatọ Eyinnaya Abaribe. Abaribe kwuru uche ya na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere sị na ebụnobi ndị Fulani ochie-ehi ji egbusi ndị mmadụ ma mebie ihe ha kọọrọ bụ iji nara ha ala ha. Akpamike ndị Fulani mekwara ka ụfọdụ dịka aka na-achị Benue bụ Samuel Ortom na onye bụbụ Mịnịsta Nchekwa Naijria bụ T.Y. Danjuma kwusie ike ka ndị mmadụ chekwawa onwe ha maka gọọmentị agaghị eme ya. Mana ugbua, ndị mmadụ na-asị ka gọọmentị etiti tinye aha ndị Fulani na-achị ehi ka ndị na-eyi egwu dika o tinyere aha ndị Boko Haram na otu Ipob. Ụfọdụ sị na yabụrụ na gọọmentị tinyere Ipob, bu ndị amaghị ka ndị na-egbu mmadụ ma ọ bụ emebi akụnaụba ka ndị 'oyiegwu', kedụ ihe aha ndị Fulani nọ na ememina ndị mmadụ kwa mgbe ejighị dị ya? Ọkachasi ebe ndị Bekee kpọrọ 'Global Terrorism Index', bụ ihe eji agbakọ ndị na-eyi egwu n'ụwa niile gụnyere ndị Fulani na-achi ehi n'ọkwa nke anọ n'ọgụgụ ndị ka akpa ike na-afọ 2015. Obụghị ndị Fulani na-achi ehi niile na-akpa ike a Ndị haziri Global Terrorism Index ahụ kwụrụ na ndị ọchịehi a sitere n'ime ndị na-asụ asụsụ Fula, bụ ndị si mba dị icheiche na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afịrịka. Mgbe ahụ, ha na-ekwu na ndị ọchịehi gbụrụ mmadụ 80 na afọ 2013, gbuo 1,229 na 2014. Ugbua, afọ ka na-agba ọkara, mana ndị nwụrụ n'akpamike a a na-ebo ndị Fulani eruola 1000. Mana, ajụjụ a na-ajụzị bụ ihe ga-eme ka etinye aha ndị ọchịehi ka ndị na-eyi egwu. Ndị Fulani na-achị ehi ha abu ndị oyiegwu? Ọ ga-amasị ọtụtụ mmadụ ma ya bụrụ na gọọmentị gara n'ihu kpọ ndị ọchịehi ndị na-eyi egwu, mana ọ bụghị ihe ga-adị mfe ma ya bụrụ na gọọmentị etiti etinyeghị uche na ya. Nichola Ibikwe bụ onye ntaakụkọ na-achọpụta ihe zoro ezo gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ọ ga-arịa ahụ ịkpo ndị ọchi ehi niile ndị oyi egwu, gọọmentị kwesiri ikewapụ ndị na-akpa ike n'ime ha. O gakwara n'ihu kwuo na ndị a na-akpa ike a bu ihe ndị Bekee kpọrọ ""militia"" n'ime ndị ochị ehi, sị na-ekwapụ ha, a ga-ekonyewe ha aha dị ka ndị na-ehi egwu. Maazị Ibekwe si na ihe eji ekenye otu dịka ndị na-eyi egwu bụ ya bụru na ha na eme ihe na ehi ndị mmadu, maọbu obodo egwu. Ndị a na egwuịsị mmadụ ma na emebi akụnaụba na ebe dị icheiche na-eme ya ka ha were yie ndị mmadụ egwu were chụpụ ha na ala ha, Ibekwe kwuru. Okwu Trump Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe Ka Buhari na Trump nwere mkparịtaụka ụbọchị Monde, Trump tinyere ọnụ n'ihe a na-eme na Naịjirịa dịka o sirii metụta nchekwa, were si na obi adịghị ndị Amerịka mma maka ogbugbu mmadu na-eme na Naịjiria. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu a ga-eme ka Buhari tinye uche etu okwesiri n'okwu ndi ọchịehi na mkpamkpa a ha na-akpa. Amabeghị ma ọ ga-eme otu a, mana tupu ọ gawa Amerịka, gọọmentị Buahri si na ha ga-amachi ichi ehi na-agagharị na steeti ebe ogbugbu mmadụ a kachasi na Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50802091,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50802091,Arsenal vs Man City: 'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha,Manchester City ji iwe ọnyụpa ha gbara kamgbe izuụka sị ka ha kugbuo ndị Arsenal n'ihu 'nne na nna ha'.,"Ha asọghị anya na ha bịara n'ụlọ Arsenal ma jiri ọkpụ goolu atọ characha a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier league. N'ime nkeji 2 ka Man City malitere tiwe Arsenal manwụ site na goolu Kevin De Bruyne nyere. A ka-akpụ nke ahụ n'ọnụ mgbe Raheem Sterling mezuru ya goolu abụọ na nkeji 15. Tupu Arsenal na-ama nke egwu na-akụ nwamadị a bụ Kevin De Bruyne gbakara neetị ọzọ na nkeji 40. N'agbanyeghi Arsenal nwara ike mana ọ dịka a ga-asị ha bụ 'Oji ọnụ agba egbe'. Ugbua Arsenal nọ n'ogogo itoolu na tebụlụ Premier league ebe Man City bụ ndị atọ. Manchester United lara na nta ọnya Everton Orie gaara ala n'isi Manchester United dịka ha nabatara Everton n'ụlọ ha n'asọmpi Premier League. Ihe mgbe Man. United si n'aka mgbe onye otu ha bụ Victor Lindelof nyere onwe ha goolu na nkeji 36. Ngwa ngwa nke a mechara, Everton kwechiri, mee ka ọ raa Man. United ahụ ịzsa goolu ahụ. Man. United sigidere ọnwụ ruo na nkeji 77 mgbe obere ụzọ neetị mepere site n'aka Mason Greenwood. Nke a mere Manchester United na Everton jiri were otu ọkpụ goolu gbaa onye lawa onye lawa. Manchester United alaghachịla n'ogogo nke isii na tebụlụ bụ nke ọtụtụ na-asị na e jiri mara ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53630437,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53630437,Ihe mere e ji kwụsị Rev. Fada Oliver Ekene Nwosu ọrụ ụkọchukwu n'ụka Catholic,Ndị ụka katọlịk na Fada Oliver Nwosu ekwuola uche ha maka akwụkwọ na-efegharị n'ịntanetị nke na-ekwu na akwụsịrị Fada Nwosu n'ọrụ maka nrụnrụaka.,"Akwụkwọ sitere Dayọsịs Maragoro nke dị na Tanzania na-ekwu na Bishop nke Ọka ekweghị ichi Nwosu ụkọchukwu maọbụ nye ya ikike ịka ụka. Akwụkwọ a gara n'ihu kwuo na ọ bụ aghụghọ ka Nwosu jiri nata ochichi dịka ụkọchukwu n'aka Bishop nke Kasana-Luwerero bụ Right Rev. Paul Ssemogerere nke mba Tanzania n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Fabụarị 2020. Akwụkwọ a kwukwara na nchụpụ a enweghị mmekwata kama na ọ kaara Nwosu mma ka o jiri aka ya gbaa onwe ya arụkwaghị m. Ihe fada Oliver Nwosu kwuru Fada Oliver Ekene Nwosu gwara ndị nta akụkọ ABS na oruola afọ ise ndị mmadụ na ndị nọ n'ọchịchị na-agba ya mgba okpuru. O kwukwara na ọ gaghị akpọ aha ndị a. Nwosu kwuru na enwebeghị akwụkwọ sị ya kwụsịtụ n'ọrụ ruterela ya ala ma sịkwa ndị mmadụ ha leghara akwụkwọ nkwụsịtụ ọrụ anya. O kwuru na ndị ọchịchị ga-etinye anya na ya bụ okwu ma sịkwa na ọnọdụ a agaghị eme ka ọ hapụ ịrụ ọrụ Chineke kpọrọ ya mee. Nwosu sị na ọ bụ iwu inyere ndị ogbenye na ndị na-enweghị etu ọ ha ha aka nke Pope Francis nyere, ka ọ na-eso. O kwuru ka mmadụ niile tinye ya n'ekpere ma tinyekwa ụka nke Kraịst n'ekpere na oge na-adịghi anya na ihe niile ga-adị mma. Ihe ndu ụka Katọlịk nwere ikwu Otu onye ụkọchukwu welitere isi n'ụka Katọlịk na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ya bụ akwụkwọ bụ eziokwu. Ọ kọwara na e nwere ụfọdụ ihe na-ezughị oke n'echichi ụkọchukwu e chiri Nwosu. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe O Kwuru na Nwosu hapụrụ Naijirịa gaa mba Tanzania were chie ụkọchukwu kama o gwaghị ha na ọ nwere nsogbu na Dayọsis ya n'Ọka. O kwuru na ọ bụ ụlọụka nyere ya ikike ụkọchukwu ma ụlọụka nwekwara ịke ịnapụ ya ikike ahụ." afirika-43835096,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43835096,Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka maka ịkpọ ha 'ndị umengwụ',Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara 'umengwụ' onyeisiala Naịjirịa kpọrọ ndị ntorobịa.,"Ndị Naịjirịa na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari na-awụ ha n'ala na mba ofesi oge ụfọdụ Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth nke a kpọrọ CHOGM, o kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ. Okwu a o kwuru atọghị ọtụtụ ndị Naịjirịa ọchị, nke kpatara ha jiri gosi iwe ha n'elu sosha midia. Onye na-ekwuchitere ọnụ Buhari bụ Femi Adesina, kwuru na ndị Naịjirịa ghọtaghiere ihe o kwuru. Ihe Adesina kwuru akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ihe dị ha n'obi. ""#LazyNigerianYouths"" na-ewu Ọtụtụ n'ime ha gara n'ihu bido igosipụta ọrụ aka ha, ma na-ekwu na ha abụghị ndị umengwụ n'agbanyeghị na ala Naịjirịa adịchaghị mma. Otu onye ọcha tinyere ọnụ ya n'okwu a. Ụfọdụ kwuru etu ha si jiri aka ha zụọ onwe ha n'ụlọakwụkwọ site na mbọ ha na-agba. Ụfọdụ kwuru na ha agaghị ebinyere Buhari aka n'afọ 2019 Otu onye ji okwu njakịrị gosi onye nwere ọrụsị ka na-eji ya arụ ọrụ" 43105673,https://www.bbc.com/igbo/43105673,Ndi agha Boko haram 475 enwerela onwe ha,"Ụlọ ikpe dị na Kainji na Niger steetị ekwuola na ha hapụla mmadụ narị anọ, iri asa na ise, bụ ndị a na-ebo na ha so na ndị agha Boko Haram.","Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ Ụlọ ikpe a kwuru na ha ga-enwogharị ha ka ha bụ ndị nwere emume ọhụrụ n'ala Naijiria. Onye oka iwu n'ikpe ha kwukwara na ha ewepụla ebubo kwuru na ha bụ ndị agha Boko Haram. Ndị agha ala Naịjirịa ji ndị a na mkpọrọ dị iche iche n'ugwu hausa, mgbe Boko haram na-ebuso ha agha. Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram ka kwụ chim chim Ufọdụ n'ime ha nọrọ na mkpọrọ ka mgbe afọ 2010. Ụlọikpe kwuru na ha hapụrụ ha makana ndi uweojii enweghị ike iweputa ihe akaebe. Abubakar Malami bụ oka ikpe ukwu ala Naịjirịa gwara BBC na ndị a ha gbapụtara ga-ahụ ezinaụlọ ha mgbe a hazịchara ha ọfụma. Ugbu a, otụtụ puku ndị agha Boko Haram na-aza ikpe n'uloikpe dị na Kainji na Niger steeti." afirika-44309618,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44309618,Akụkọ kachasị n'abali a: Sineti ga-enyocha akụkọ onye nkuzi OAU,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ụlọọrụ Sineti enwela mkpebi ọhụrụ,"Ụlọ omeiwu nta na Naịjirịa ekpebiela na ha ga-enyocha akụkọ mere n'etiti onye nkuzi na nwata akwụkwọ ọ chọrọ i dina. Ihe a mere ka mahadum Obafemi Awolowo kwụsị onye nkuzi ahụ ọrụ n'ike. Taa bụ oke ụbọchị nyere ndị mwereonwe Biafra N'Enugwu, Nnewi, Aba,Onitsha gbara chakoo taa dịka ndị mmadụ mere onyenọrọbeya maka ncheta Biafra Aba, Enugwu, Nnewi na obodo ndị ọzọ gbaghara ahịa na ọrụ n'Igwe n'ụbọchị ncheta agha Biafra. Mana Owere na umuahia biri ndụ ha ka o nweghị ihe na-eme. Ebe ọzọ na Naịjirịa Akụkọ na-ekwu na a maala Jolly Nyame bụ Gọvanọ chiburu Taraba steeti ikpe mkpọrọ ihe ruru afọ ịrị n'anọ Ụlọịkpe kwukwara na Nyame agaghị enweta ohere ida nha kama ị ga mkpọrọ. Na mba ofesi Arkady Babchenko bụ onye ntaakụkọ Rọshia e chere na ọ nwụrụ n'izuụka gara aga pụtara na nzụkọ ndị ntaakụkọ. O kwuru na o mere emume ọnwụ a iji zọọ ndụ ya dịka o nwetere ozi n'ụlọọrụ a kpọrọ 'Kremlin' na-achọ igbu ya. N'egwuregwu, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari agwala otu 'Super Eagles' ka ha gbaa mbọ hụ na ha meriri asọmpị iko mba ụwa ha tozuru ịga Ọ sị na olileanya nde nari iri naasatọ ndị Naịjirịa dị na ha. Gee nkeji mgbede anyị ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu" afirika-49149923,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49149923,Building Collapse in Lagos: Ndị mmadụ ka tọrọ n'ụlọelu dara na Legọs ụbọchị ụka,Ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru ụlọelu nke dara n'ogbe Osasa nke dị na Bariga na Legọs Steeti n'abalị ụnyaahụ bụ ụbọchị ụka.,"Ụlọ ịda na Legọs abụzịghi akụkọ ọhụrụ. Ndị ọrụ gbata gbata gọọmentị Legos dị iche iche nọ ebe ahụ ụgbua na-achọ otu ha ga-esi zọpụta ndị tọrọ atọ. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na a kpụpụtala mmadụ isii mana amabeghi mmadụ ole ka tọrọ n'ala. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ gbatagbata nke steeti Legọs bụ Kenny Adebayo gwara BBC na ha ga-agbalị ole ha nwere ike iji hụ na a zọpụtara ndị nile ya bụ ihe metụtara. Ụlọelu dara na Bariga Ụlọ ọdịda bụzị ihe na-eme kwa daa na Legọs. N'ọnwa Maach afọ a, otu ụlọakwụkwọ dara na mpaghara Ita Faaji nke Legọs. Mmadụ iri na asatọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ ebe mmadụ iri anọ na otu. Ndị ọrụ gbatagbata na-agbalị ịkpọpụta ndị ka tọrọ n'ụlọ ahụ Akụkọ ka na-abịa. Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Etu esi ahazi Ji Kpacha" media-49148561,https://www.bbc.com/igbo/media-49148561,Insecurity: Anyị ga-enye onye Igbo ọbụla nwere mmasị ichi ehi nkwado,Gọvanọ ise ndị ọwụwa-anyanwụ ekụliela n'ọgbakọ mbụ ha nwere kemgbe ọnwa Mee mkpụru ụbọchị iri abụọ na itoolu ha nweghara ọchịchị.,"Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Ha tinyere ọnụ na ọkpụrụkpụ okwụ ụfọdụ metutere steeti ọwụwa-anyanwụ nke gụnyere nchekwa, Ruga, akụ na ụba nakwa ihe ndị ọzọ. Ndị nọ na ya bụ ọgbakọ bụ Gọvanọ Ugwuanyi (Enugwu steeti), Okezie Ikpeazu (Abia), Osote gọvano Anambra na Imo steeti bụ Nkem Okeke nakwa Gerald Irona. Ndị gọvanọ a kwekọrịtara ihibe kọmiti ga-elebe anya n'ọrụ nchekwa bụ nke a ga-ehibe otu ndị nche ọrụ ha bụ ilekọta ndị nche n'ime ọhịa na ụzọ niile dị n'ọwụwa-anyawụ gbaa gburugburu. N'ozị ọ gụpụtaara ndị nta akụkọ, onyeisioche nzụkọ ahụ bụ Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, kwuru na ndị otu a ga na-agba ama maka ọnọdụ nchekwa na steeti ndị a. Ha sị na ndị kọmiti a ga-ahụkwa maka nchekwa ọnwa, paịpụ, mmanụ agbidi gafere ala Igbo. Ha kwusikwara ike na ọwụwa-anyanwụ enweghị ala maọlị maka ogige ndị ọchịehi akpọrọ Ruga. Umehi kwukwara na gọmentị ha ga-akwadọ onye ọbụla nwere mmasị na ọrụ ịkpa ehi, ezi, osikapa nakwa akụkụ ubi ndị ọzọ. Ha gwara ndị ọbụla nwere mmasị n'ọrụ ndị a gaa na steeti ha dị icheiche maka nke a. Nzuko a kwara arịrị maka ọnọdụ ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam International bụ nke dị n'Enugwu bụ ebe ha kpọkuru gọmenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. Ha jakwara Gọvanọ Ugwuanyi ike maka mbọ ọ gbara n'ihu na ya bụ ọdọụgbụelụ ka na-arụ ọrụ ugbua. Ndị gọvanọ a jikwa ohere a kpọkuo gọmenti etiti ka ha bịa mezie okporoụzọ awara-awara nke Enugwu-Ọnisha, Enugwu-Pọtakọtụ, Okigwe-Owerri nakwa Owerri-Umuahia dịka ha kelere ha maka ọrụ ha n'akwammiri nke abụọ oshimiri Naịja. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri anyị ebe a Etu esi ahazi Ji Kpacha" afirika-44129843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44129843,Ihe m gabigara n'aka ndị ọchịehi - Mbaekwe,"Chinedu Usman Mbaekwe kọwaara BBC Igbo ihe ọ gabigara oge a tọọrọ ya na 2017, ma kwuo na ụjọ anaghịzị ekwe ya gbaa n'okporoụzọ.","Usman Mbaekwe: Obi ka na-amapụ m ugbua n'ihi ihe m gabigara Akụkọ kwuru na atọrọla ihe ruru mmadụ iri asatọ na asaa na Kaduna n'ụbọchị ụka, nke a kpalitere ọtụtụ mmadụ ikọwapụta ihe ha gabigara n'aka ndị ntọ mmadụ maọbụ ndị ekperima n'okporụzọ na Naịjirịa. Mbaekwe bụ otu n'ime ndị atọọrọ n'okporoụzọ, gwara BBC Igbo na obi ka na-amapụ ya ugbua ma enwee ka mmadụ si nyachie ya ihu ma ọ na-anya ụgbọala ya, maka etu ndị tọọrọ ya si nyachie ya. O kwuru na mmadụ asatọ tọọrọ ya n'ụbọchị iri na atọ (13) nke ọnwa Maachị 2017, jide ha ụbọchị anọ tupu a hapụ ha ka a kwụchara ha nde naịra abụọ na puku narị ise (N2.5m). Gee ntị ka ị nụ ihe o kwuru maka ihe ọ gabigara: Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ. Mbaekwe kwukwara na ọ bụ ndị nọ n'ụlọ na-akacha ata ahụhụ ma atọrọ mmadụ maka na onye atọọrọ ma ụdịrị nsogbu ọ nọ n'ime ya mana ndị nọ n'ụlọ ga-eche ihe ọjọ niile nwere ike imego onye ahụ. Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ. Lee ihe nkiri a ịhụ ihe ome ihe nkiri bụ John 'Mr Ibu' Okafor gabigara n'aka ndị na-atọ mmadụ. Mr Ibu: Ndị tọrọla m nyere m ego" afirika-48212087,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48212087,Imo State: E kposaala ndịisioche okpuruọchịchị 27,"N'ụbọchị Tọzdee, Ụlọomeiwu Imo steeti kposara ndịisioche nke okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa na steeti ahụ.","Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Ndị omeiwu a gwaziri ha ka ha nyefee ọchịchị n'aka ndị osote ha. A na-ebo ndịisioche a ebubo na ha nupụrụ isi ịbịa kọwaa ka ha na ije siri gaa kamgbe ha weghara ọchịchị n'uloomeiwu steeti ahụ. Mana otu onyeisioche okpuruọchịchị na-achọghị ka akpọọ aha ya, boro ndị uloomeiwu ahụ ebubo na ha kposara ha n'ihi na ha jụrụ inye ha ego aka azụ. Onyeisiala enyela Emefiele ikike agba nke abụọ Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti ga-abịaghachi ọzọ. Okwu a si n'akara ekwentị onyeisioche ụlọmeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki. Cheta na a nụrụ kepukepu na ọ gaghị enweta ohere agba nke abụọ maka na onyeisiala sị ya gaa ezumike. Mana ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ etiti bụ Isaac Okoroafor gbaghara nke a kwuo na ọ bụghị eziokwu. Na mba ofesi Ka anyị gaa na Sawụt Afrịka ebe ngụpụta ihe karịri ọkara vootu niile a tụrụ na ntuliaka mba ahụ gosiri na otu ndọrọndọrọ bụ Africa National Congress bu ụzọ ugbua Otu Democratic Alliance so ya n'azụ, ebe otu Economic Freedom Fighters nọ n'ọkwa nke atọ. Okwu Chuwkwueze ebiela Akụkọ na-eru anyị ntị n'egwuregwu e kwuola na otu Villareal emechala hapụ Samuel Chukwueze ka o gbara N aịjirịa bọọlụ n' asọmpị iko mba Afrịka nke na-abịa. Chukwueze ga-eso ibe ya malite ọzụzụ n'Asaba n'ọnwa Juun. Gee Nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Onyeisi ndị uweojii amapụtala amụma ịkpa ndị ntọ eze Ndị uweojii azọpụtala mmadụ 27 a tọrọ gụnyere ndị Chaina mmadụ ise. Mmadụ iri na abụọ n'ime ha bụ ndị a tọrọ na Zamfara steeti na steeti ndị ọzọ,ebe ndị Chaina ise ahụ bụ ndị a tọrọ na Bobi dị na Naija steeti n'abalị 15 nke ọnwa Eprelu afọ a. Mana ndị uweoji siri imi n'ala ma gbapụta n'ọhịa dị na Birnin Gwari, Kaduna steeti. N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba wepụtara, a gbagburu ndị ntọ abụọ dịka ha na ndị uweojii na-akwa mgbọ. N'otu aka ahụ, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu nọrọ n'Abuja ụbọchị Tọzde malite atụmatụ ọhụrụ a kpọrọ 'Operation Puff Adder' maka iji buo agha megide ntọ na Naijiria. Adamu kwere nkwa na njedebe mkpamkpa ndị omekome adịla nso. Rochas akwaala arịrị Gọv. Rochas Okorocha Rochas Okorocha na-akwa arịrị na-ekwu na ajọ agwa a kpasoro ya n'APC dị njọ ugboro iri karịa ihe ya gaara eme ya maọbụrụ na ọ na PDP. Mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja Okorocha sị na agbanyeghị nke a na ọ ka kwụchịm na Pati APC. NLC ahụla ihe ha atụghị anya be Ngige NLC mere ngagharị iwe be Ngige N'otu Abuja ahụ, ịkwe n'aka agafeela mpi aka n'okwu dị n'etiti Nigeria Labour Congress na Mịnịster ndị ọrụ bụ Chris Ngige. Ndị a sịrị na ha bụ ndị agboro merụrụ ndị NLC ahụ ebe ha na-eme ngagharị iwe n'ihu ụlọ Chris Ngige n'Abuja. Mmadụ itoolu n'ime ndị ọrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ụlọikpe mkpegharị ewetuola Adeleke aka Ademola Adeleke zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018 Unu anụla na Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja sị na ha ekweteghị n'ihe ụlọikpe nta kwuru na ọ bụ Sịnetọ Ademola Adeleke meriri na ntuliaka gọvanọ Osun Steeti. Ụlọikpe nta kwuru na Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa gọvanọ meriri Gboyega Oyetola nke APC na tulaika gọvanọ e mere na steeti ahụ. Nke a mere Gboyega Oyetola nke APC na-achị steeti ahụ jiri rịọwa ụlọikpe mkpegharị ka ha lebe anya na ya bụ ikpe. Ntuliaka Sawụt Afrika Ramaphosa ga abụ onyeisiala ma Zuma rituo Na mba South Africa ka atụm vootu na-abịa n'isi njedebe, onyeisiala ha bụ Cyril Ramaphosa arịọla ọhanaeze mgbaghara maka oke mpụ na nrụrụaka ọ sị kechiri mba ahụ ọkpa. Ya bụ onyeisiala so na-azọ ọkwa na-arịọ ka a gbaghara patị ha bụ ANC ma nyekwa ha ohere ọzọ ịdozi ya bụ mba. BBC achụọla onye ntaakụkọ ha BBC achụọla onye ntaakụkọ ha maka akụkọ ịkpa oke agbụru o dere n'akara Twitter banyere nwa ọhụrụ ọkparaeze Harry na Meghan mụrụ n'ịzuụka a. Danny Baker gosiri foto dị na nwunye du adaka yị uwe dee na ""nwa Eze ahapụla ụlọọgwụ"". Otu a ka Danny sị jiri aka ya detere onwe ya ajọ ihe. Ajax 2 - 3 Tottenham Ụmụibe egwu tara akpụ ụnyaahụ n'etiti Ajax na Tottenham ebe ọfọrọ tinkọm tinkọm ole ka egbuchie ya bụ asọmpi mgbe Lucas Moura tinyere goolu nyere Tottenham mmeri. Tottenham ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie Ajax nke mere na ha na Liverpool ga-akwata n'agba nke ikpeazụ. Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Night runners: 'Ịta amusu dị n'agbụrụ ezinaụlọ anyị' Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-51592333,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51592333,Chelsea vs Tottenham: Lampard akuzierela Mourinho na 20 bụ ọgụ,"Frank Lampard na-achịkọta Chelsea kuzirila Jose Mourinho na ""Twenty bụ ọgụ"" dịka Chelsea wefere obi azụ wee nyụọ Tottenham anya mgbe ha zutere taa.","Nkuzi a bịara dịka Chelsea ji goolu abụọ a satara otu jide azụ ụlọ ha ma merie Tottenham. Tupu egwuregwu a ebido, ndị mmadụ chere na a ga-agwọ Chelsea ara dịka ndị Man Utd si gwọọ ha n'abalị Tusde, mana ha chị ọkụ bata, wee gosi Tottenham nkarị. Goolu abụọ Olivier Giroud na Marcos Alonso nyere, zuru inye ha pọịntị atọ ha ji jaa eze ma kute ume ndụ. Lampard gbanwere mmadụ anọ o jibu gbaa egwuregwu nke Manchester United, mere ka o nweta mmeri a mezuru ya ugboro abụọ ọ na-emeri Mourinho. Giroud kwuru na mmeri a gbara ha ume dịka obi dara ndị Chelsea mba maka etu ha si agbabu, ebe ọ bụ mbụ ọ na-eso Chelsea ebido boolu n'ime ọnwa atọ. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka nọkwa n'ogogo anọ, mana ha nwere pọịntị 44 nke ha ji anọ n'ime ya na-aga Tottenham na-eso ha n'azụ." afirika-56454315,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56454315,"World Water Day 2021: Ihe na-acha ọbara ọbara ma n'esi isi agbarụọla mmiri Nvụna na Nomeh, Enugwu Steeti",Ndị Nomeh na Nkanu East dị n'Enugwu Steeti nọ na nsogbu ịta nkịkịrị eze ugbua n'ihi na nanị otu mmiri ha na-aṅụ bụ Nvụna na-achazị ọbara ọbara ma n'esi isi.,"Ihe izizi onye ọbụla bịara na mmiri Nvụna ahụ ga-achọpụta bụ na ya bụ nnukwu mmiri na achazị ọbara ọbara, ụfọdụ ebe na-acha oji oji, ọ na esi isi nke ukwuu, ebe anụmanụ niile nọ na ya dịka azụ na agụ iyi, nwụrụ anwụ. Ndị Nomeh tiri nkpu gwa BBC na ha nọzị na nnukwu ụkọ mmiri, n'ihi na ya bụ mmiri Nvuna bụ ebe ha si aṅụ mmiri, asa akwa, esi nri, nakwa ihe niile eji mmiri eme n'ihi na ha enweghị mmiri tapụ na be ha. Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị gwara anyị okwu kwuru na ya bụ mkpa mkpa mere na ụbọchị tuzde 15th Marchị 2021 oge ha pụtara n'ụtụtụ ikuta mmiri were hụ na mmiri ha adịghịzị ọcha, kama ọ na achazị ọbara ọbara ma na esi ajọ isi. Onye ọbụla jiri ọsọ gbapụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, ya bụ mmiri na achazị oji oji ma ka na esikwa isi. Oti nwoke Nomeh kwuru na ha na eche ma onwere ka esiri wunye kemịkalụ adịghị mma na ya bụ mmiri. Ha kwukwara na ha ezipụla ọtụtụ mmadụ ka ha gaa n'obodo bụ agbata obi ha dịka Ituku iji mara ebe odachi ahụ siri bido. Ha na-ayọkwa gọọmenti la ọhnatar ha ọsọ enyemaka makana ka mgbe mmiri Nvuna mebiri ha na azụzị 'pure water” nke otu akpa mmiri bụzị N20, nnukwu akpa N200. BBC gakwara na ụlọ Igwe ndị Nomeh bụ Rtd.It. Col. ION Mbachukwu mana ọnọghị n'ụlọ ya. Anyị agbaala mbọ ịnweta ya bụ onye eze n'ekwe ntị ya mana ọmịtaghị mkpụrụ. Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara" afirika-51194239,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51194239,Nigerian English: Okwu Nigeria 28 banyere 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020,Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020?,"Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford English Dictionary' nwere mkpụrụokwu ruru 830,000 Okwu ndị a bụ okwu Bekee bụ so onye Naijiria maọbụonye ya na ndị Naijiria mekọrọla ihe nwere ike ịghọta so n'okwu ndị na-ede Oxford Dictictionary gụnyere n'okwu Bekee. Okwu dịka okada bụ ihe a na-akpọ onye ji ọgbatumtum achụ nta ego;buka maọbụ 'mama put', bụ onye osinri na-anọ ọgbaụzọ nakwa K-leg bụ okwu e ji akọwa onye ụkwụ ya gbara ngọ. Dịka ozi onyeisi na-elebanye anya uche onye na Oxford Dictionary' bụ Danica Salazar sịkọwaa, site na iwere asụsụ Bekee mee ya nke ha, ndị Naijiria enyela nkwado pụrụ iche nye asụsụ Bekee dịka asụsụ ozuru mba ọnụ. Lee okwu ndị a hụ banyere Oxford Dictionary n'ọnwa Jenụwari afọ a: 1. agric, adj. & n. -Nke bụ mkpọbiri 'Agrịculture'- orugbo 2. barbing salon, n.- Ebe a na-akpụ isi 3. buka, n. Ụlọ nri okporoụzọ 4. bukateria, n. - Ụlọ nri okporoụzọ 5. chop, v./6- Iri 6. chop-chop, n./2 - Iri ego ọha, nrụrụaka 7. danfo, n. - Obere ụgbọala e ji achụ nta ego 8. to eat money, in eat, v. - Iri ego 9. ember months, n. - Ọnwa mba mba 10. flag-off, n. to flag off in flag, v.- Ibido 11. gist, n./ gist, v./2 - Akụkọ/ Ịkọ akụkọ 12. guber, adj. - Ihe gbasara ọkwa gọvanọ 13. Kannywood, n. - Ndị na-eme ejijie Ugwu Awusa 14. K-leg, n. - Ụkwụ ngọ 15. mama put, n. - Osinri na-anọ n'okporoụzọ 'Buka', osinri ahịa okporoụzọ so n'okwu ọhụrụ banyere 'Oxford Dictionary.' 17. Next tomorrow, n. & adv. - Nwanne echi 18. non-indigene, adj. & n. Onye abụghị nwa amaala 19. okada, n. oji ọgbatumtum achụ nta ego 20. to put to bed, in put, v. Ịmụ nwa 21. qualitative, adj.- Ịdị ezigbo mma 22. to rub minds (together) in rub, v./1 - Itikọta isi chee echiche 23. sef, adv. - Onwe 24. send-forth, n. - Mziga maọbụ mzipụ 25. severally, adv. - Ugboro ugboro 26. tokunbo, adj. - ụgbọala maọbụ ngwa ahịa si aka fere aka 27. zone, v. - Mpaghara 28. zoning, n. - Ike na mpaghara na mpaghara 'Ain't' sokwa Ọ bụghị sọ okwu Naijiria banyere akwụkwọ nkọwa okwu n'afọ 2020. 'Ain't so na ụfọdụ okwu Bekee anaghị akpọbu okwu zuru oke a gụnyere n'okwu zuru oke na akwụkwọ nkọwa okwu. 'Ain't' bụ okwu e ji akọwa 'ọ bụghị,' 'abụghị m', 'ha abụghị' bụ okwu anabatara dịka okwu zuru oke na Bekee. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49872694,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49872694,Abia State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia state,Mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria niile juputara n'ihe akụ ọnatarachi nke nwere ike ime ka steeti niile dị na ya baa ọgaranya ma ọ bụrụ na-emezie ha nke ọma.,"Ọbụghị nnu niile ka a na-eri eri Nke a ga-eme ka gọọmentị steeti ndị dị n'ala Igbo kwụsị ibe akwa ego kwa mgbe kwa mgbe. Ka anyị lee Abia Steeti na ihe ndị Chineke ji gọzie ha nke nwere ike ịmịtara ha ego ma e lebaa ha anya. 1. Mmanụ Agbidi (Crude Oil) Mmịpụta mmanụ agbidi emebiela ọtụtụ ala nakwa osimiri n'ọtụtụ obodo ndị nwere ya. Abịa so na steeti nwere mmanụ agbidi nakwa ikuku gas na Naịjiria. Ebe mmanụ agbidi dị n'Abia steeti gụnyere okpuru ọchịchị dị na ọwụwa anyanwu nakwa ọdịda anyanwụ Ụkwa (Ukwa east and west). E nwere ụmị mmanụ agbidi n'ebe ndị a: Imo River, Obuzo, OwazaNgboko, Nkali, Odogkwa nakwa Isimiri 2. Iron Ore 'Iron ore' bụ akụrụngwa dị n'ala nke e ji emepụta igwe na ihe ndị ọzọ. Ihe dị ka rọọdụ e ji arụ ụlọ nakwa igwe e ji arụ akwa mmiri nke Bekee kpọrọ 'steel' bụ 'iron ore' ka e ji emepụta ha. 'Iron ore' bara ụba n'okpuru ọchịchị Isikwuatọ. 3. Laterite E nwere ike iji 'laterite' arụ ụlọ Nke a juputara n'ala Abia steeti niile. 'Laterite' bụ ihe na-adị n'ime aja ụpa nke na-acha mmeemmee. E ji 'laterite' arụ ihe dị icheiche dịka ụzọ nakwa akụrụngwa ndịọzọ e ji arụ ụlọ. 4. Shale na Limestone Igwe e ji akwọri 'limestone' Shale bụ ọkpụrụkpụ nkume nke sị na aja ụpa were pụta. Limestone bụkwa nkume ọcha e ji arụpụta ihe dị icheiche E ji 'shale' akpụ ihe ọkpụkpụ jirikwa ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'tiles' nakwa 'bricks'. Agwakọọ 'shale' na 'limestone', a na-eji ya emepụta 'cement'. 'Shale na Limestone' bara ụba na mpaghara Bende, Isikwuato, Ohafia nakwa Arochukwu. 5. Black Marble 'Black Marble' 'Black Marble' bụ okwute ojii na-egbuke egbuke. Ọ na-ada oke ọnụahịa ma bụrụkwa ihe mara mma iji dozie ụlọ. Ị gaa n'Osisioma Ngwa na Ugwunabo, ebe ahụ ka e nwere 'black marble' nke ọma. Ọ bụrụ na ị biara Aba n’afọ 2014, ị ga-amata ịhe ndị anyị rụọla- Ikpeazu 6. Glass sand Nke a bụ aja e ji emepụta 'glass' dịka enyo, ugegbe, dịrị gawazie. A na-ewere aja a sie ya n'ọkụ o we gbazee dịka mmiri tupu ewerezie ya mepụta 'glass'. Aja ndị a bara ụba na mpaghara Ukwa east na west. A ga-ahụkwa ya na mpaghara Isiala Ngwa North na South, nakwa Aba North na South. 7. Salt Ọbụghị nnu niile ka a na-eri eri Na mpaghara Bende ka e nwere nnu n'uju. Uru nnu bara dị ọtụtụ, ọbụghị naanị maka iji ya esi nri. E jikwa nnu emepụta ncha, jirikwa ya eme nke bekee kpọrọ 'dyeing' nakwa 'bleaching'. Nnu na-enyekwa aka n'ịkpụ ihe ọkpụkpụ. E nwekwara nnu nke mmadụ enweghị ike iri eri. 8. Bentonite Clay Nke a bụkwa ụdị aja na-adị nro n'aka ma makwaa mma. Ọ na-enye aka idozi anụ ahụ nke mere na e ji ya arụpụta ihe ndị e ji achọ mma . Na mpaghara Umuahia na Umuahia South ka e nwere 'Bentonite Clay' n'uju. 9. Kaolin 'Kaolin' 'Kaolin' bụ ụdị nkume e nwere ike iji mepụta ihe Bekee kpọrọ 'Ceramics'. E jikwa 'Kaolin' arụ ọgwụ nwere ike ịkwụsi otoro maọbụ afọ ọsịsa. Ị ga-ahụ Kaolin n'Ikwuano, Umuahia, nakwa n'ebe ụfọdụ na Isikwuato. 10. Gypsum Gypsum bụ ihe e ji arụpụta nzu bekee a kpọrọ 'chalk'. E jikwa ya arụ ọgwụ nakwa 'Plaster of Paris' (POP). Lokpaukwu bụ mpaghara e nwere 'Gypsum' n'ụba. Matakwa na Abia steeti bụkwa obodo e ji ịkọpụta nri mara, nke bụ na elezie ya anya, ịkọ nri nwere ike ime ka steeti a baa oke ọgaranya. Ọzọkwa bụ na Abịa nwere ihe ga-amasị ndị na-eme njem nlereanya. Ebe dịka 'National War Museum nke dị n'Umuahia, ebe e nwere Ojukwu bọnka, nakwa ọtụtụ ọgba (caves) dị n'Arochukwu nakwa Amakama. Ọ dịzi n'aka ndị ọchịchị Abia steeti ileba anya n'ihe ndị a iji hụ na nkụ dị na steeti ahụ ga-eghere ha nri. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị?" afirika-47384000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47384000,Leicester City: Brendan Rogers na Kolo Toure anarala ọchịchị,Leicester City enyela Brendan Rogers ọrụ onye nchịkọta otu ha na-erughi ụbọchị atọ ha chụrụ Claude Puel.,"Ka ha na-ewe Rogers chịkọtaburu otu egwuregwu Liverpool site n'afọ 2012 ruo 2015 n'ọrụ, ha kpọbatakwara Kolo Toure gbaburu bọọlụ ọtụtụ afọ n'Arsenal, Liverpool na Manchester City. Ọ kpọbatakwara Chris Davies nakwa Glen Driscoll ga na-elekọta ahụike ndị otu a. Cheta na Rogers na Toure rụkọrọ ọrụ n'otu egwuregwu Celtic, ebe Rogers buliri iko asaa n'ime otu afọ na ụma. N'akwụkwọ ọrụ Rogers dị afọ iri anọ na isii binyere aka, ọ ga-anọ na Leicester City ruo ọnwa Juun afọ 2022. Mmeri Buhari Ọ bụrụ na ị nụbeghị, ka anyị gbaara gị ama na Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachịla ịchị Naịjirịa afọ anọ ọzọ. N'okwu o kwuru iji nabata mmeri ya, o kwere nkwa ịgbalị karịa mbụ n'ihe gbasara nchekwa, akụnaụba nakwa ibuso mpụ agha. N'ịkpọpụta onye meriri, onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na Buhari nwetere vootu karịa nke onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar, ma mezuo ihe iwu kwuru, nke mere o ji pụta ka onyeisiala. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ PDP Ajụla mmeri Buhari Otu pati PDP ajụla ịnabata mpụtara kpọpụtara aha Buhari dịka onye meriri ntuliaka, ka ha na-ekwu na akaebe si n'ọgbọ ntuliaka dị iche iche gosiri na ọ bụ Atiku Abubakar ka ndị Naịjirịa họpụtara. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ ndị n'ọchị ndị n'akwa maka ndị ha kwadoro na ya bụ ntuliaka. N'ofesi, Ihe ruru mmadụ iri isii ka tọrọ n'ime ebe a na-ezo ezo egwuputa ọlaedo n'ime ala, n'obodo Sulawesi dị na mba Indoneshia. Ndị ọrụ gbatagbata mba ahụ sị na otu onye anwụọla ebe a gụpụtarala mmadụ iri na atọ. N'egwuregwu, Goolu abụọ Angel Di Maria nyere na otu nke Meunier gbakpuru, nyere PSG mmeri na be ha ka ha zutere Dijon n'asọmpi Coupe De France. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ibeawuchi" afirika-43431933,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43431933,Ụlọịkpe Israel azọọla ndị mbịambịa sị Afrika,Gọọmentị ala Isreal anaghị enwe ike ịchụ ndị mbịambịa sị na mpaghara Afrịka maka nkpebi ọhụrụ ụlọikpe nke Isreal mere.,Ọtụtụ n'ime ha na-agba ọsọ ndụ maka agha Ụlọikpe a kwuru na onye ọbụla chụrụ ndị nbịabịa na Isreal na-enupu isi n'iwu. Nkpebi a na-abia otu ụbọchị gọọmentị kwuru na ha na-enyocha ajụjụ niile so na omume nke a. Ọ bụ ndị mbịambịa sị ala Eritrea na Sudan ru otu narị na iri abụọ binyere aka n'akwụkwọ akpọrọ petition na bekee riọ ụlọịkpe ka ha mee ha ebere. Ọtụtụ n'ime ha ka na-achọ akụnaụba n'ala bekee Ụlọịkpe nyere ndị gọọmenti ruo ụbọchị iri abụọ na isi n'ime ọnwa nke a ka ha zaa ịkpe a mana ha kwukwara na tupu ụbọchị a ruru gọọmentị anaghị achụ onye mbịambịa ọbụla. Ụlọikpe a kwukwara na nkpebi a anaghị emetụta ndị mbịambịa kwuru na ha chọrọ ị pụ n'ala Israel. Mana osote onyeisiala Isreal bụ Tzipi Hotovely ekwuola na nkpebi a gosiri na ụlọikpe nke ala Isreal anaghị ahụ Isreal dịka ala were onweha. Ndị nbịanbịa sị npaghara Eritrea na Sudan na-agba ọsọndụ makana agha na-esu na ala ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-43312906,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43312906,Ndị Sineti akụpụla alo ka ụmụnwaanyị NYSC yiwe peteri,Ndị ọgbakọ omeiwu nke ukwu bụ Sineti kwuru na inye ohere 'onye yiri ihe masịrị ya' ga-ebute nsogbu n'ime ndị ji otu afọ efe Naijiria nke a kpọrọ NYSC n'aha ịchafụ.,"Sineti kwuru na inye ohere 'onye yiri ihe masịrị ya' ga-ebute nsogbu n'ime ndị ji otu afọ efe Naijiria nke a kpọrọ NYSC n'aha ịchafụ Dịka Sinetọ Emmanuel Bwacha na-anọchite Taraba bụ onye tụtara alo a siri kwuo: ""Ihe na-ebutekarị esemokwu n'iwu NYSC bụ iwu na ndị ji otu afọ efe ala nna anyị ga na-eyi traụza. Nke a megidere okpukperechi ụfọdụ ụmụnwaanyị. Imegharị ya bụ iwu ga-ebute nsogbu a na njedebe."" Mana Sinetọ Suleiman Adokwe na-anọchite Nasarawa kwuru na ""nsogbu imegharị iwu ahụ ga-ebute ga-akarị ahụhụ a ga-ata imegharị ya."" Ebe Sinetọ Sam Egwu na-anochite Ebonyi kwuru ""Anyị ekwesịghị ịna-egbu oge imegharị iwu anyị enweghị ike imegharị."" Akụkọ ga-amasị gị: Na okwu ya, Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi Sineti ma bụrụkwa onye nọ n'isi oche mkparịtaụka nke ndị Sineti ụbọchị ahụ, kpọrọ oku ntuliaka nke okwu ọnụ ebe ndị jụrụ ka emegharị iwu ahụ karịrị ndị kwenyere. Ekweremadu gara n'ihu kwuo: ""Anaghị m agba mbọ ka m kwụsị alo ahụ. Ọ bụrụgodu na anyị tinye aka na ya, a ga-ezigaya na steeti niile ka ha tinye aka ha na ya dịka ịwuala anyị siri kwuo.""" egwuregwu-48005945,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48005945,Everton vs Man United: A bọkasịala Man United ka ọkụkọ 'Easter',Manchester United agbakwala ọnyụpa ọzọ dịka ha natara mkparị n'aka Everton ndị gbara ha ọkpụ goolu anọ asataghị otu.,"Man United malitere nkeọma mgbe ha kwanyere Everton ọkụ n'ike na mmalite asọmpi a. Mana Everton tụgharịrị buru ụzọ sụnye Man United goolu nke Richarlison nyere na nkeji 13 site n'enyemaka Calvert-Lewin. Dịka a ka kpụ okwu n'ọnụ na nkeji 28, Everton si n'aka Sigurdsson gbawakwuo obi ndị Man United n'inye goolu nke abụọ. Everton nọ n'enwete onwe ha dịka ha ekweghi Man United kpaa ike ọbụla ruo mgbe agba nke bụ kwụsịrị na nkeji 45. Dịka agba nke abụọ malitere, Lucas Digne nke Everton, gbara aka ahịa n'imezu goolu ha atọ na nkeji 56. Ebe a ka ike nọ gwụzie ndị Man United, ọ dị zie ka ha amaghị nke egwu na-akụ. Ebe Everton nọ bọọzie Man United ka ọkụkọ 'Easter' bụ na nkeji 64, mgbe Theo Walcott nyere goolu nke anọ, nke mere ọkpụ anọ chara acha asataghị otu. Merie a bụ mbụ Everton ga-eji ọkpụ goolu ruru anọ merie Man United kamgbe afọ 1981. Dịka ọ dị ugbua, Manchester United nọ ndị isii ns tebụlụ Premier League n'ọnụ ọgụgụ 64. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45301752,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45301752,N' Enugwu ndị ntaakụkọ agwala gọọmenti ka ọghara ịdị na emegbu ha,Ndị ntaakụkọ niile ji Enugwu mere ọnụdụ ezukọtala soro ndị Ogbo ha na Naịjiria mee ngagharịiwe maka mmegbu a na-emegbu ha.,"Ndị ntaakụkọ nọ n'Enugwu steeti agwala gọọmenti ka ọ ghara imegbu ha. Onyeisi ndị otu NUJ n'Enugwu bụ Rex Eze kwara arịrị na ndị uweojii, DSS na ndị ọzọ na etikarị ndị ntaakụkọ ihe ma kpochie ha na nga na eleghị anya n'azụ. Chris Isiguzo bụ onye na achịkọba NUJ na odịda anyanwụ dọrọ ndị nchekwa na gọọmentị aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n' ofe ma hapụ ndị ntaakụkọ ka ha rụba ọrụ ha. Isiguzo kwuru na obi adighị ha mma na gọọmentị Oyo state kwaturu ụlọ mgbasa ozị Ayefele na eleghị anya na-azụ. Onye ntaakụkọ Sun n'Enugwu bụ Ralph Ede kọrọ ka ndị uweojii nke a kpọrọ SARS siri tie ya isi aba okpu, ma kpochie ya n'ụlọ mkpọrọ n'ihi na ya na-arụ ọrụ ya. Ha bugasị akwụkwọ edepụtara iwe ha were mee ya bụ ngagharịiwe n'Enugwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45608233,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45608233,Anyị ga-akwado onye ga-arụrụ ndị Igbo ọrụ - Ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo,Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo n'ụwa niile bụ Kingsley Dozie ekwuola na onweghibeghi pati ọbụla ha na-akwado n'ime ntuliaka na-abịa.,"Anyị chọrọ mmepe ala Igbo O kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ajụjụ banyere kepukepu na otu a gwara pati PDP ka ha nye ndị ọwụwanya osote onyeisiala na ntuliaka afọ 2019. Dozie kwuru na ọ bụ ndị otu ha akwụsịrị ọrụ na-enweghi ezigbo ntuziaka kwuru ụdị okwu dị etu ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ha ga-akwado bụ onye ga-aghazigharịobodo Naịjiịa, nke ọzọ bụ onye ga-eme ka ọnọdụ ndị Igbo dị mma n'azụmaahịa nakwa ihe niile. O kwuru na agbanyeghi mpaghara onyeisiala na osote ya si pụta, na ọ bụrụ na onye ahụ ga-ezi ndị Igbo anya nke ọma, na ha ga-akwado ya. N'okwu ya ""Ọ bụghị naanị ndị ntoroọbịa ga-ekpebi nke a, kama Ohanaeze Ndigbo nke Nnia Nwodo bụ onyeisi ha, Imeobi Ndigbo gụnyere ndị gọvanọ, ndị Eze Igbo na ndị ichie n'ala Igbo."" Dozie sị na ọ bụ naanị ya nwere ikike ikwuchite ọnụ ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo dịka ọ dị ugbua. ""Anyị e degara pati abụọ kachasị na Naịjirịa ugbua akwụkwọ ozi bụ nke rụtụrụ aka n'ihe Ndigbo chọrọ, iji nweta nkwado si n'aka Ndigbo "" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 50186049,https://www.bbc.com/igbo/50186049,Nigerian Celebrities: Lekwa ihe mere ka ndị a ama ama wuo n'ízu a,"Dịka izuụka a na-abịa n'isi njedebe, anyị na-ewetara gị ihe ndị ama ama ụfọdụ mere nke dara ụda. D AVIDO","Obi bụ Davido sọ anụri dịka enyị ya nwaanyị, Chioma mụrụ nwaa nwoke na Sụnde gara aga. Kama ndị osochiegbu bịara ime ya obi ọjọọ mgbe ha boro ya ebubo na ọ tụwara otu n'ime ha ime. Ụmụagbọghọ a mechara kwugharịa si na ha na-ama ya njakịrị. Ha rịọkwara Davido ka ọ gbaghara ha na ọ bụ egwuregwu. Kama Davido sị 'Njakịri laa azụ' ha ka atakwute ya kọnkịrị n'ụlọ mkpọrọ. Okey Bakassi Okey Bakassi gbara afọ iri ise n'ụbọchị Wenesde. I mara afọ ole Okey Bakkassi dị? Otụtụ amaghị mana nwoke a agbaala afọ iri ise. Bakassi mezuru ya afọ iri ise ọnọọrola n'elụ uwa n'ụbọchi Wenesde gara aga. Lekwa ụfọdụ ozi ekele ezitere ya. Meghan Markle,'Duchess of Sussex' Harry na Meghan bụ aha nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ n'izu a. Ha abụọ bụ Duke na Duchess nke obodo Sussex dị na mba Ịmgland. Ụfọdụ kwuru nke di mma ebe ụfọdụ kwuru njọ maka ha. Mana Meghan akatọọla etu ndị ntaakụkọ si ebu akụkọ maka ndụ ya na ezinụlo ya. Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya - KANYE WEST Egwu Kanye West tipụtara mere ka #Jesusislord wuwe na Soshal Midịa Kanye West wuru na Sọshal Midịa maka egwu ọhụrụ o tipụtara, ọkachasị nke ọkpọrọ 'Jesus is Lord'. Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya. FRODD Frodd onye ezigbo aha ya bụ Chukwuemeka Okoye gọsipụtara obi mwute o nwere dịka ọ gara leta ndị Onịcha ọkụ tanka gbara metụtara. Lee ihe ekwuru maka njem ya na Twitter CHIZZY ALICHI Chizzy Alichi na ndị BBC Nwaada a makarịrị 'mamiwọta' na mma biara nọnyere BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde. O sonyere n'ihe omume anyị a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ'. Lee ka o siri gaa. Akụko ga-amasi gị Ihe nkiri ga-amasi gị: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'" 42979368,https://www.bbc.com/igbo/42979368,Port Harcourt e kporola ọkụ taa n'ekeremgba,"Tata bụ Wesde, Eke 7-2-18 ka ekeremgba an akụ n'Alfred Diete Spiff Civic Centre, Pitakwa na-egwuruegwu nke Wrestling Championship nke mba Afrika.","Oduayo Adekuoroye napụrụ onye Japan ọla edo na mgba ndị dara 55kg n'afọ 2017 Ya bụ ọgbọ egwuruegwu ga-anabata ike ka ike n'ekeremgba na mba iri abụọ na ise n'Africa. Ha ga azọ ihe nrite ọla ọcha na ọla edo karịrị otu narị na iri asatọ, dịka TheGuardian siri buo. Mba Egypt, Naịjirịa na Tunisia kachasị ewete ịhe nrita egwuruegwu a na-mbụ. Nke mba Afrika biagoro egwuruegwu a Dịka nta akụkọ siri kwuo mba iri na otu ndị Afrika a wuchilearị na Port Harcourt. Mba ndị a bụ Kenya, Namibia, Liberia, Burundi, South Africa, Tunisia, Egypt, Morocco, Algeria and Sudan. Ebe a na-atu anya ndị ọzọ na-ụbọchị na-abia n'ihụ. Onye nọ n'isi ịhazị ya bụ egwuruegwu bekee kpọrọ Chairperson of the LOC, Boma Iyaye bụkwụ Kọmishona egwuruegwu dị na-aka na River Steeti sịrị na-ihe niile ezuola maka nkwado ya bụ egwuruegwu. Boma jikwa ohere a kele Gọvanọ Wike maka ịkwado ya bụ egwuruegwu mba Afrika. A na atụ anya ndị niile Naịjrịa jị eme ọnụ n'ekeremgba n'ọgbọ a. Ndị dịka Oduayo Adekuoroye bụgoro ọkamgba nke mba Afrika ụgbọro asaa, Blessing Oborodudu nakwa Nwafọ Igbo bụ Ifeoma Nwonye bụ ọkamgba nke ụmụnwaanyị ụgbọro ise na mba Afrika. Nkea bụ mbụ a na-eme egwuruegwu a na Naịjirịa nke ụmụnwoke na ụmụnwaanyị so agba. Anyi ka agba mbọ i kwuru onye nhazi egwuruegwu a dị na-aka na River steeti" egwuregwu-44313775,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44313775,Ndị Egypt ekwuola na Salah ga-eso gbaa iko mba ụwa,Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Egypt na-akọwa na Mohamed Salah ga-eso sọọ mpi na-mbido iko mba ụwa na Rọshịa.,"Mohammed salah kwapụrụ nku mere e ji na-atụ ụjọ ma ọ ga-aganwu Rọshịa Cheta na ọ dị ka Salah agaghị eso gaa Rọshịa ka o merụrụ ahụ na nku aka n'asọmpi ngwụcha Champions League Liverpool na Real Madrid gbara n'izuụka gara aga. Salah dị afọ ise ji anya mmiri pụo n'asọmpị ahụ. Onyeisi ngalaba n'ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Egypt bụ Hani Abu Reda, onye nchịkọta ndị otu egwuregwu Egypt bụ Hector Cuper na Mohamed Abou El-Ela na Salah zutere ụnyaahụ na Valencia, ebe ọ na-anata ọgwụgwọ. Ndị na-akwado Mo Salah ga-enwe aṅụrị ma ọ bụru na ọ gaa iko mba ụwa Ihe ngalaba a dere na Facebook kwuru: ""Ndị si ngalaba na-ahụ maka otu egwuregwu Egypt nwetara ozi maka etu onye egwu a ji na-agbake. Ọ na-aga ije ọfụma ma chọkwa isonye na ndị ga-aga iko mba ụwa, ma nwekwaa agbamume onye egwu pụrụ iche chọrọ ịchụkwute ndị otu ya."" N'onwe ya, El-Ela kwuru na Salah agaghị anọ ruo izuụka atọ tupu ọ gaa soro ndị otu ya. Egypt ga-agba bọọlụ nke mbụ ha na Roshịa n'ụbọchị 15 nke ọnwa Juun bụ mgbe ha na Uruguay ga-ezụkọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45064769,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45064769,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena bụ akajiakụ mbụ ụmụnwaanyị,"N'egwuruegwu, a kpọpụtala Ezenwaanyị tenis bụ Serena Williams dịka onye mbụ na ndị akajiakụ n'egwuruegwu ụmụnwaanyị na mba ụwa.","N'egwuruegwu, Serena Williams bụ akajịakụ mbụ n'ụmụnwaanyị ndị egwuruegwu Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa Akwụkwọ mgbasa ozi Forbes dere nke a ụnyahụ. Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ ebeela akwa Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjịrịa agbarụọla ihu maka etu ha che na gọọmenti etiti sị abado ọrụ mmepe na mpaghara ahụ.Ha kwuru nke a mgbe ha gara ịlebe anya na ihe ndepụtara maka otu gọọmenti etiti siri rụọ ọrụ mmepe na mpaghara n'afọ 2017 bụ nke ha sị na ojucheghị afọ. Mana gọọmentị etiti sị na ha na-enweta oke ruru ha A maala Paul Manafort ikpe ịgba ọsọ ụtụisi Manafort rituru dịka onye nchịkọta ndọrọndọrọ ọchịchị Trump n'ime ọnwa abụọ obidochara ọrụ Nelson Chamisa bụ onye so zọọ ọkwa ọchịchị onyeisiala ndị Zimbabwe, ekwuola na aka enwe bara na ya bụ ndọrọdọro nke ya na Emmerson Mnangagwa zọrọ ụbọchị anọ gara aga. Mnangagwa mechara merie na ya bụ ndọrọndọrọ dịka e si kpọpụta ụnyaahụ. Enwere kepukepu na-achọrọ ibuki ụkwọ ọnwa ndị NYSC nsonso a Minista na ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na ọnweghị mgbe gọọmenti etiti ji kweta maka ibuli ụkwọ ọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna akpọrọ NYSC na Bekee Na otu aka ahụ, onyeisiala Mohammadụ Buharị kwukwara n'uche ya ka dị na-ịkwado ụmụ amala ahụ ji otu afọ efe ala nna. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị 2019: E ji Ndigbo eme akaje" afirika-52808202,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52808202,Coronavirus in Nigeria : Ana m agọtara ndị Ipob mana ha na-ebochi m ọnụ-Nnia Nwodo,Onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na o nweghị mgbe ya ji echere ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) echiche ọjọọ ma ya fọdụ ịkpa nkata megide onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.,"O kwuru nke a n'ọsịsa ebubo na aka ya dị na 'Egwu Eke' nke dị agha Naijiria gbara n'Ọwụwa Anyanwụ iji kpachie otu Ipob na Nnamdi Kanu. Na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ ""Urban Radio"" dị n'Enugwu nwere ụbọchị Tuzde, Nwodo sị,""Otu ihe na-ewute m n'ihe ụmụokorobia anyị, tụmadị ndị Ipob, bụ na unu na-ebochi mmadụ ọnụ."" ""Unu ebozina m ihe m na-ekwughị maọbụ ihe m na-emeghị. Ị gaghị abụ onye Biafra karịa m."" 'Ihe o jiri dị mkpa na Ndigbo niile ga-apụta tuo vootu' Nwodo, onye kwuru na ya anọrọla n'ọtụtụ ọgbakọ gọchitere ndị Ipob na ha abụghị otu na-eyi egwu mana,""kedụ ihe mere unu ji ebochi m ọnụ?"" ""Agara m na Chatham House were gwa ha na 'Fulani herdsmen' bụ ndị kachasị egbu mmadụ dịka global terrorist Index, sị ha na ụmụaka be anyị ebughị egbe, na ọnụ ka ha ji ekwu, n'agbanyeghị ya a kpọọ ha 'terrorists'. ""E dere akwụkwọ degara United Nations kwuo na o nweghị ihe ndị Ipob mere."" Ọ gara n'ihu kwuo na ya tụrụ ihe onyonyo nke gosiri ebe ndị agha Naijiria na-agwọ ụmụntorobia Igbo n'ụrọ n'ihu GOC 82 Division n'oge Egwu Eke, ma gwa ya na ọ na ọ gbasoghi usoro United Nation ""Rules of Engagement"" nyere. Nwodo dọrọ ndị ntorobia na ndị otu Ipob aka na nti ka ha wepụ aka enwe n'ofe, kwụsị ịkparị ndị okenye Igbo dịka o kwuru na ha na-ewetara Igbo aha ọjọọ n'ihu mba ndị ọzọ. N'okwu gbasara mmechi ahịa n'ihi coronavirus, Nwodo kwuru na o nweghị onye ọ na-atọ ụtọ ikpochi kama ọ bụ maka ọdịmma ọha mere. Na nkọwa ya, mmachi obodo na-emetụkwu gọọmentị dịka ha anaghị enweta ego ụtụisi ha kwesịị inweta ma ọ bụrụ na enweghị mmachi. Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: Nnubata ndị Ugwu n'oge ""lockdown"" N'okwu nnubata ndị Ugwu n'oge mmechi obodo, Nwodo kwuru na ya degaara Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi gwa ya na ndị mmadụ anaghị agbaso mmachị ngagharị, na ndị ọrụ nchekwa anaghị agba mbọ etu o kwesiri ịhụ na a gbasoro ya. N'okwu gbasara nchekwa ala Igbo, Nwodo sị: ""N'ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ikpeazụ e nwere, ndị gọvanọ agwala ndị ụlọomeiwu steeti ha ka ha lebanye akwụkwọ iwu maka nchekwa steeti anya, ka ha mee ya iwu. ""Akwụkwọ ahụ bụrụ iwu, ọ ga-enye gọọmentị steeti ikike ọrụ nchekwa nke aka ha."" Nwodo, onye kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na-ama jijiji maka mbata ndị Ugwu, gwara ndị Igbo ha dere jụụ na ""Ndị be anyị nọ nche."" Ọ rụtụrụ aka na, n'agbanyeghị na ndị ntorobia si Ugwu Awụsa na-enubata, na anụbeghị mkpamkpa n'ala Igbo dịka ụdị a na-anụbu mere na Kaduna, Benue, Kano ""nke a gosiri na anya nche nọ nche"". Mụrụ anya dịka azụ Mana ọ kpọrọ oku ka onye Igbo ọbụla mụrụ anya dịka azụ, onye hụrụ ihe dị aghaa, bekuo ndị gọvanọ, ndị omeiwu na ndị Ohaneze. ""O nweghị nke anyị nụrụ anyị agaghị eme ihe gbasara ya, mana ọ bụghị nke anyị mere anyị etibe mkpu ihe anyị mere."" Ihe onyonyo ochie so efegharị Mana Nwodo gara n'ihu kwuo na ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị nso nso a na-egosi ndị ugwu zoro n'ime ụgbọala, bụ ihe mere ochie. Ọ sị, ""Abalị ole na ole gara aga, Gọvanọ Edo kwuru na ihe onyonyo gosiri ndị si n'ụgbọala Dangote arịpụta bụ ihe onyonyo ihe mere ọtụtụ afọ gara aga."" Okporo gaasị nke goomenti na-arụ site Imo gaa Legọs ""Anyị sị na ọ gaghị aga ma ọ bụrụ na ha ekesaghị ya na be anyị, makana gaasị bụ ụzọ kachasị ọnụala inye ọkụ latrik."" ""Ọ ga-enyere ụlọọrụ mmepụta ngwahịa dị n'ala Igbo aka."" Akụ ruo ụlọ... Nwodo rịọrọ ndị isioche okpuru ọchịchị nakwa ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ka ha rụọ injini na-apa akwụ ka ndị nọ n'ime obodo nwee ebe ha na-emepụta mmanụ n'uju. Ọ gwara ndị Igbọ na-achụ nta ego na mba ndị ọzọ ka ha cheta na akụ ruo ụlọ, o kwuo ebe o si. ""Ọ bụghị ile ihe onye ọzọ metara ka e ji aba ụba, ha gaa ala Igbo rụọ ụlọ mmepụta ngwaahịa."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56501441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56501441,Ugo Ugochukwu: Ihe i kwesiri ima gbasara nwa Oluchi Onweagba-Orlandi,Ugo Ugochukwu bụ nwa onye ngosi(model) a ma ama bụ Oluchi Onweagba-Orlandi na di ya bụ Luca Orlandi.,"Ugo Ugochukwu, nwa Oluchi na di ya bụ Luca Orlandi Ọ bụ nwadịala malitere ịnya ụgbọala ọsọ n'ezigbo oge. Ugo gbara sọsọ afọ iri na atọ abụrụla otu nwatakịrị n'ewu ewu ugbu a dika ụlọọrụ 'McLaren Racing' zụrụla yi ka onye ga na-agbara ha ọsọ ụgbọala. Ugo nwetala nturugo mmeri na mba Amerika nakwa Europe site n'ima aka asọmụmpi FIA OKJ European Championship e mere n'afọ 2020. Kedụ afọ mụrụ ugo a? Luca Orlandi,Ugo oge ọ dị obere na Oluchi Onweagba Nne ya Oluchi Onweagba bụ nwada Igbo mba ụwa ji eme ọnụ dika ọ chakere site na ime ihe onyonyo iga ije nganga 'modelling' bido mgbe ọ gbara afọ iri na isii. Oluchi na-ere ahia mbugari na Leg os tupu akara aka ya chakee ka o sonyere n'asompi 'Nokia Face of Africa' n'afọ 1998 ebe o meriri were site ebe ahụ bụrụ onye a ma ama n'ụwa dum. Di ya bụ Luca Orlandi bụ onye o zutere n'ọrụ ya bụ onye Italị a ma ama n'ọrụ ịdụ akwa ndị nwere agba, bụ ọrụ e jirila mara ezinaụlọ ha agbụrụ kwuru agbụrụ. Ọ bụ ya nwe ụlọrụ na-adụ akwa azụrụ eyiri ụmụnwaanyị a kpọrọ Luca Luca' nke ọ malitere n'afọ 1991. Nne ya bụ Oluchi kele Chukwu n'ụzọ pụrụ iche n'ihi isiọma nwa ya nwetara ste n'aka ụlọọrụ ""Mclaren Racing': Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ha:" afirika-52038420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52038420,Coronavirus in Nigeria: Nwaada Igbo ahụ bi n'Amerịka anyị gbara ajụjụọnụ ebughịzikwa coronavirus,"Nọsụ dị ime bi na New York gwara BBC Igbo na ya bu Coronavirus, ebughịzị ya.","Nwaanyị ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na o mere nyocha ọzọ wee chọpụta na o bughịzi ya. Dịka ụwa niile na-ama jiji maka ọrịa coronavirus, nwaafọ Naịjirịa bụ Chi Onu ekwuola na ọrịa a abụghị ikpe ọnwụ. Chi Onu bụ onye ọrụ ahụike n’obodo New York nke mba Amerịka. Ọ bụ ebe ọ na-eleta ndị ọrịa ka o butere coronavirus. Mana o kwuru na onweghi ihe ọbụla mere ya kemgbe ahụ. O kwuru sị: “Oge a chọpụtara na m nwere coronavirus, akwụsịrị m ọrụ ka m ghara ibufe ya ndị ọzọ.” “O ruola ụbọchị 13 m mechara nnyocha mana onwebeghi ihe ọbụla gosiri na ahụ adịghị m.” “Ma di m na ụmụ m, onweghi onye ahụ na-arịa na-agbanyeghi na mụ na ha na-enwe mmekọrịta etu anyị si emebu.” Chi Onu kwuru na ndị coronavirus na-emesi ike bụ “ndị nwere ọrịa ngụgụ maọbụ ọrịa obi, ndị na-enwe nsogbu iku ume, ndị nwere ọrịa kansa na ndị mmgbochi ọrịa ha (immune system) esichaghị ike.” Ọ dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ na-eri mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ma zeere mmiri oyi, ‘ice cream’ na ihe ndị jụrụ oyi nke na-enye nje coronavirus ohere ịmụba. O kwukwara sị: “Onye ọbụla atụla egwu, kama kpachapụ anya.” “Ịtụ egwu nwere ike ịkpata mgbochi okuku ume nke ga-eme ka mmadụ chee na ya nwere ọrịa coronavirus.” “Coronavirus dị n’ezie. Ya bụ ọrịa ariala m, riakwaa ọtụtụ ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ, nakwa ọtụtụ ndị m na-eleta dị ka ‘nurse’.” “Ọrịa a egbuola ọtụtụ, mana ọtụtụ agbakeekwaala.” Chi Onu kwuru ka onye ọbụla gee ntị ma rube isi n’iwu gọọmentị. “Nọrọ n’ụlọ, zekwaara mmekọ gị na ndị mmadụ ka ị ghara ibute maọbụ bufee mmadụ ọrịa.”" afirika-52890627,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52890627,Nigeria lockdown update: Lee usoro ọhụrụ a ga-eji aka ụka maka coronavirus,"Ngalaba Onyeisiala Muhammadu Buharị hiwere maka ọrịa coronavirus a kpọrọ ""Presidential Task Force"" ewepụtala etu ụlọ ofufe ga-esi eme ofufe dịka ewepụrụ mmachi nnọkọ n'ụlọ ofufe.","Ọ bụ onye na-achịkọta ngalaba a bụ Sani Aliyu wepụtara usoro ndịa a n'ụbọchị Tuzde. Lee usoro ndị a ebe a 1) Tupu mmadụ abata ụlọ ofufe ọbụla, ha ga-asa aka ha, yiri mkpuchi ihu, nyocha etu ahụ ha sị ekpo ọkụ ma were ""Hand Sanitizer"" hichaa aka ha. 2) A ga-eme ka ahụ na mmadụ nyere mmadụ ibe ya ohere nke bekee na-akpọ ""Social Distancing"". 3) A na-adụ ndụmọdụ ka mmadụ hapụ ibi ọma, ịkwe n'aka, isusu ọnụ na mmetụ ahụ ndị ọzọ. 4) Enye kwara ndụmọdụ ka ezinụlo na anọko ọnụ n'ụlọ ụka. 5) Ndị na-arụ ọrụ n'ụlo ụka dịka ndị na-anabata ndị mmadụ (Ushers), ndị na-agụ egwu, na ndị nche bụ ndi nwere ọrịa ọzọ ekwesịghị ị so rụọ ọrụ. 6) Ofufe agaghị akarị otu awa 7) Ụlọ ofufe ndị nwere ọtụtụ mmadụ ga-eke oge ofufe ha iji hụ na mmadụ na mmadụ ibe ya nwere ohere, ma a ga-enyekwa nkeji iri atọ tupu ha ebido ofufe ọzo ka ndị mmadụ nwee ike ịsa aka ha. 8) Ụlọ alakụba ga-enwe nkeji iri abụọ tupu ha ebido ekpere ma mechie nkeji iri abụọ ma ha mee cha ofufe. 9) A gaghị enwezị ụlọ akwụkwọ Islamiya. 10) A ga-eme ka oge ekpere dị nkenke 11) Ụzọ ọpụpụ na nke mbata ga-adị iche n'ụlo ofufe niile Ugbua, ụdị ekele udo ndị a ga-akwụsị iji hụ na e gbochiri mfesasị ọrịa coronavirus n'ụlọụka. 12) Ndị mmadụ agaghị anọkọ n'ezi ma emecha ofufe 13) Ndị na-ere ahịa na mpaghara ụlo ofufe agaghị emepe 14) Ndị okenye rugoro afọ iri ise na ise kwesiri ị nọ n'ụlo mee ofufe nke ha 15) Ulo ọfufe nille ga-agba mbọ hụ na ha na-edebe ebe niile ọcha. Nke a pụtara na ndị mmadụ ga-amalite ịnọpụrụ onwe ha iche n'ime ụlọụka, ihe dịka mmadụ abụọ n'otu ogologo oche. 16) A ga-emepe windo n'ihi na ọ ga mma karịa imechi ebe niile 17) Ofufe emere na mbara ezi kacha mma 18) A ga-ehicha ụlọ ofufe mgbe niile 19) A ga-eji ""Bleach"" etinyere mmiri ehicha ụlọ ofufe ndi a Ndị mmadụ na-ajụ sị ""Kedu maka oriri nsọ"". 20) Ndị na-enwe njirimara ọrịa Covid-19 agaghị a bịa ụlo ofufe 21) Ụlọ ofufe niile ga-edebanye aha ndị ọrụ na ndị niile bịara ofufe 22) Ndị nyocha gosipụtara na ahụ ha dị ọkụ nke ukwu agaghị abata ụlo ofufe 23) Ọ ka mma ị nọ n'ụlo mee ofufe karịa ị ga-ụlọ ofufe Akụkọ ndị ga-amasị gị: Naịjirịa amaka" egwuregwu-57222381,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-57222381,"Ka Chelsea, Liverpool maọbụ Man United gbunye Arsenal ncha ka ha sapụ ụchụ","Asompi Premier League nke ụbọchị taa bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke afọ 2021 dị ""Behube!""","Chelsea ejirila anya ọnwụ na ndụ tozuo ịgba Champions League Ndị n'ọchi, ndị na-akwa na ndị ""A chọrọ m ịma"" juru ebe niile. Manchester City buliri ya bụ iko kama Chelsea, Liverpool na ManUnited chịtara ntozu asọmpi Champions League kama enwefghị ebe ahụru ndi otu Arsenal. Lee ka o siri gaa na nkenke. Manchester City Ọ na-akpọtụ n'ogige ndị otu Manchester City dịka a ga-echi ha Eze na Premier League nke afọ 2021 taa. ManCity ji akara iri na abụọ chara acha were aga ndị na-esote ha n'azụ bụ Manchester United. Ha bọrọ ndị Everton ka ọkụko igbo dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị am ncha were mee ha ọbịa. Mmadụ niile ma na Mancity bụ Eze a ma na-aga echi nke mere ka ụche mmadụ niile nọorọ maka ndị ga-eozi ịgba asọmpị Champions League nke afọ 2022. Ndị otu ga-agba asọmpi Champions League Manchester United Manchester United etozuola ịgba asọmpị Champions League nke afọ 2022 dịka ha bụ ndị nke abụọ na tebulu asọmpị premier League. Na asọmpị ikpeazụ ha, ha meriri otu Wolves site n'ịnye ọkpụ goolu abụọ a satara otu. Liverpool Liverpool emeghị etu ọtụtụ ndi mmadụ siri tụọ anya dịka ha siri maa n'afọ gara aga ebe ha buru ịkọ Champions League. Kama ha jisiri ike were kụpụ ndị otu Chelsea were bụrụ ndi nke atọ na tebulu Premier League. Ọ bụ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ma ncha were merie ndị Crystal palace na asọmpị ha gbara na mgbede taa. Taa bụkwa ụbọchị Ikpeazụ Georginio Wijnaldum gbara bọọlụ dịka onye otu Liverpool. Ya gaziere ya. Chelsea FC Chi ndị otu Chelsea mu anya dịka ha tozuru ịgba asọmpị Champions League na-agbanyeghị na ndị Aston Villa ji goolu abụọ ha satara nanị otu were merie ha. Ọ bụ dịka ndị Leicester City gbara ọnyụpa mere ka otu Tottenham were jiri goolu anọ ha gbalịrị sata abụọ were gosi ha nkarị n'ụlọ ha. Ọ bụ ihe mere ka ndị Chelsea were nanị otu akara were tabanye na ndị ga-aga gbaa champions League. Leicester City? Leicester City emezughị ihe ndị nkwdo ha tụrụ na'naya dịka ha nyere ndị Tottenham ohere iji goolu anọ ha satara nanị otu were gwọọ ha ịba n'ụlọ ha. Kama ha ji Iko FA cup were kasie onwe ha obi. Kedụ maka Arsenal? Otu Arsenal gba aka dịka ha bidoro n'abalị were chọwa ewu ojii. Ya bụ ewu gbanaharị ha dịka ha achịtaghị aja n'asompị niile a gbara. Arsenal FC gba aka n'izu a Ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ma ncha were merie ndị Brighton." afirika-44348461,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44348461,Ejima kpụkọtara ọnụ anwụọla na Tanzania,Maria na Consolata Mwakikuti bụ ụmụ ejima kpụkọtara ọnụ anwụọla site n'ọrịa mkpụrụ obi na mba Tanzania.,"Maria na Consolata kwuru okwu ị lụ di mgbe ha ka nọ ndụ. Ụmụ nwaanyị ahụ kpụkọtara ọnụ site n'otubo gbadaa nwere otu umeju na otu akpa ume kama ha nwere mkpụrụ obi abụ na aka dị ịcheiche. Ha gara ụlọọgwụ dị n'obodo ha n'ọnwa disemba maka nsogbu mkpụrụ obi tupu ha anwụọ ụnyaahụ bụ Satode. Akụkọ ọnwụ ha butere oke mwute na mba Tanzania n'ihi na ha bụ ndị ama ama ma hụ kwa na-anya nke ukwuu. Onyeisiala mba Tanzania John Magufuli dere n'elu Twitter n'ọnwụ a wutere ya nke ukwu n'ihi na ejima ahụ chọrọ ị fee ala ha. Lee ebe Magufuli kwuru nke a ma na-eti ezinaụlọ ha aka n'obi maka ọnwụ ejima ahụ: Maria na Consolata jụrụ atụmatụ ọbụla ikewa ha site n'ọwụwa ahụ, ma na-ekwu ""anyị nwere olileanya ị lụ otu di n'oge adịghị anya"" Mgbe BBC gbara ha ajụjụ ọnụ n'afọ 2017 ha kwuru na ha chọrọ ị bụ ndị nkuzi ma ha gụchaa Mahadum. Ọ bụ ndị enyemaka ụka Katọlịk Maria Consolata zụrụ ha ebe nne na nna ha nwụrụ mgbe ha ka dị obere. Igwe mmadụ zitere ha ozi ekele n'afọ gara aga ha gụchara akwụkwọ sekọndrị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43736423,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43736423,Kedu ihe mere ndị egwuregwu Afịrịka ji agbafu n'ofesi?,"Ụnyaahụ bụ ụbọchị 11 n'ime ọnwa Maachị, ndị otu mba kamerụn kwuru na ha na-achọ ndị egwuregwu ha a ruru 8 so ga Australia maka egwuregwu Commonwealth.","Ndị ọrụ Kamerun kwuru na Arcangeline Fouodji Sonkbou bụ onye na-ebuli igwe so na ndị egwuregwu na-efu Ha kwukwara na ọ dịka ndị a ""gbafuru"" ma kwuo na ha agwala ndị uweojii mba Australia maka ihe a mere. BBC Igbo kpọrọ ndị egwuregwu dị icheiche maka ị chọpụta ihe mmere ọtụtụ ndị egwuregwu na-agbafụ oge niile ha gara ala bekee maka i so n'asọmpị egwuregwu ọbụla. Onye ọgba bọọlụ Super Eagles n'oge gara aga bụ Emmanuel Babayero gwara BBC na ihe a na-eme maka ndị a ahụghị ala nna ha n'anya. Mmadụ asatọ n'ime otu ndị Cameroon ka ha na-achọ achọ N'ọnụ okwu ya: ""gọọmentị ala dị icheiche n'Afịrịka kwesiri ị na tinye n'ime obi ndị mmadụ ihunanya gbasara ala ha."" Mana Enefiok Bassey bụ onye nkuzi ndị obu igwe nwere atụmatụ ọzọ ọ sị bụ ihe patara ihe a. O kwuru n'ugbua ndị egwuregwu n'Afịrịka na-ata ezigbo ahụhụ. Bassey kwuru na: ""ọtụtụ n'ime ndị egwuregwu a enweghị ego ị rị nri ọbụla, ya mmere oge ọbụla ha nwere ohere ị ga ala bekee maka egwuregwu ọbụla ha na-agbafu."" Usoro dị mma ị ga-esị eme ya Otu onye na-agbasa ozi gbasara ihe egwuregwu bụ Niran Adesanya kwuru na onye egwuregwu ọbụla chọrọ ịnọchite anaya mba ọzọ, nwere ike ime ya site na n'usoro igafe nke Bekee kpọrọ ""defection"". Adesanya kwuru na: ""ihe a ga-abụ nkwerikọta otu egwuregwu ala ha na ala ndị ọzọ nwere. Ọ ga-abụkwa nke a tinyere aka n'akwụkwọ. Ihe a bụ ihe ha na-eme eme."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42814495,https://www.bbc.com/igbo/42814495,Arsenal gbara Chelsea 2:1 wee banye agba ikpeazu Carabao Cup,Onye nkuzị bọọlụ ndị Arsenal bụ Arsene Wenger na akọwa na ndị otu ya sara anya ha mmiri kemgbe ha rere Alexis Sanchez.,"Arsenal ebutebeghi ihe a na-akpọ 'local cup' kemgbe Wenger banyere ọkwa naotu asọmpi ahụ Arsene Wenger kwuru nke a ka Arsenal si na azụ were saa ọkpụ goolu otu Chelsea nyere ha nwere merie 2:1 na asọmpi ha gbara ụnyahụ. Arsenal na ndị Manchester city ga ezukọ na-mmechi Carabao cup. na 25/2/18. Ọ Eden Hazard bu onye bu ụzọ nye goolu, mana onye otu ya Antonio Rudiger gbabara bọọlụ na ọnu goolu nke ha, mezie ka goolu Granit Xhaka nke Arsenal nyere nye ha (Arsenal) mmeri. Ihe a mere ụbọchi abuo ha rere Sanchez nye ndị Manchester United, were gote Henrikh Mkhitaryan ka ọnọchie. Onwa one na one garaaga tara ndị Arsenal akpụ. Ha rịturu na ọkwa na Premier League, bia bụrụ ndị isii, wee pọint iri abuo na ato na azụ Manchester City, bu ndị na achị Premiere League na afọ a. Mana, ha na-ele anya na mmeri a ga akwalite ha ka ha nwete iko anọ ha ga enwete na afọ ise. Ha buuru Carabao Cup a, ọ ga a bụ iko mbu nke mba England Wenger na ebụte kemgbe ọ bidoro ọrụ na Arsenal. Wenger sị, ""E chem na anyị kwụrụ nnukwụ ụgwọ maka amaghịama nọ na Arsenal na Janụwarị, mana anyị na ahụzị ụzọ nke ọma ụgbua. Anyi ma ihe anyị kwesịrị ime. Anyi tinyere uche na asọmpị anyị. Anyị ma na-Alexis Sanchez dị anya mkpa mgbe ọ nọ ebea, mana kita anyi ma otu ihe sịrị kwuru, anyị ma otu anyị ga esi hazie ihe a.""" afirika-52918196,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52918196,Rape in Nigeria: Ebubo ụgha maka mwakpo na-emebi agha a na-ebuso mwakpo - Uti Nwachukwu,Onye a ma ama n'ihe onyonyo bụ Uti Nwachukwu abaala mba maka ebubo mwakpo otu nwaanyị boro ya.,"Ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị na akara ahụ kpọrọ aha ya bụ akara adigboroja nakwa na o nweghi isi. Ọ bụ otu nwata nwaanyị kpọrọ onwe ya Kambili Korie bụ onye boro Nwachukwu ebubo nke a. Uti depụtara n'akara instagram ya ka ndị ahụ gaa kpesa ya n'aka ndị uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya. ""Agwala m ndị ahụ ha gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii maọbụrụ na m mere nke a n'ezie mana o nwebeghị onye bịara"" O kwukwara na ebubo a wutere ya nke ukwuu n'ihi na ọ bụ onye na-achọ ọdịmma nakwa ikike ruru ụmụnwaanyị mgbe niile. ""A bụ m nwoke nwere ụmụnne ndị nwaanyị anọ, nke a mere ihe niile gbasara ọdịmma ụmụnwaanyị jiri masị m"" ka o kwuru Mgbe BBC Igbo gara ị me nyocha gbasara ya bụ okwu maọbụ gbaa nwa agbọghọ boro ya bụ ebubo ajụjụ ọnụ, ọ zaghị anyị chaa chaa. Ihe ọzọ anyị hụrụ bụ na emechiela akara Twitter o jiri depụta ya bụ ozi akpọrọ @KambiliKorie. Uti kwukwara na n'agbanyeghi nke a, ọ ka ga-aga n'ihu na nyocha ndị uweojii na-eme n'ihi na ọ chọrọ ịzọpụta aha ya kpam kpam! Kemgbe a wakporo ma gbuo otu nwa agbọghọ bụ Uwavera n'obodo Benin, ọtụtụ ụmụnwaanyị amalitela ikwu ihe anya ha hụrụ na mwakpo nakwa ịkpọpụta aha ndị wakporo ha. Ndị ọzọ a ma ama e boro ebubo mwakpo Ụfọdụ ụmụnwaanyị pụtara na soshal midia na-ebo ụfọdụ ndị a ma ama ebubo mwakpo. Ndị a gụnyere; 1. Brymo Olawale Otiegwu a ma ama bụ Brymo Olawale so na ndị eboro ebubo mwakpo n'elu soshal midia. Brymo n'onwe ya apụtala ị gọ ya bụ ebubo ma kwuo na ụlọ egwu ya nakwa gọọmentị Legọs steeti etinyela aka ọnụ ịme nyocha banyere ebubo ahụ 2. Dapo Adebanjo (D'banj) D'banj bụ otiegwu ọtụtụ ụmụ Naịjirịa hụrụ n'anya bụ aha ọzọ wuru ewu na soshal midia dịka e boro ya ebubo mwakpo. Rue ugbua o nwebeghi ihe o kwuru gbasara ya bụ ebubo. 3. Tobechukwu Victor Okoh (Peruzzi) Peruzzi bụ ezi ọyị Davido sokwa na ndị aha ha banyere n'ebubo mwakpo nwaanyị. O gbughị kwa oge n'ịgọrọ isi onwe ya site n'akara Twitter ya ebe o dere na ""ọ bụghị onye mwakpo"" 4. Chimaobi Owoh (Zoro) Otiegwu eji egwu ""Ijele"" mara bụ Zoro apụtala kwuo ka o si metụta ya. O kwuru na otu nwa agbọghọ boro ya ebubo mwakpo ma kwukwa na mgbe ndị ụlọọrụ ya chọrọ ịnwe mkparịtaụka, ya bụ nwa ada etie mkpu ""mmegbu"" Lee ihe o dere ebe a Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44746104,https://www.bbc.com/igbo/44746104,Uru na ọghọm dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka Buhari hiwere - Ọkaiwu,"Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na ọ dị mma ime iwu ịkpachi akụ ndị nọ n'ọkwa gọọmenti a na-ebo ebubo mmerụaka-nke a kpọrọ Executive Order on Corruption"" mana ọ bụ ụlọomeiwu ka ọ dịrị ime nke a.","Ibuso nrụrụaka agha so na nkwa Muhammadu Buhari kwere na ọchịchị ya ga-arụ tupu ọ banye n'ọkwa onyeisiala Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ka gọọmenti nwee ikike ịkpachi akụ na ihe onwunwe ọrụ gọọmentị maọbụ onye nọ n'ọkwa ọchịchị a na-arụ aka imefu ego ala Naijiria ruo mgbe ikpe gbasara ya biri n'ụlọikpe. O kwuru na iwu ọhụrụ ga-anapụ ndị tinyere aka na mpụ akụ ha kpatara n'ụzọ akwụghị ọtọ, iji gbochie iji ya eduhie ndị na-eme nnyocha maọbụ ikpe. Dịka Ọkaiwu Eze, onye bụ onyenkuzi mahadum na 'Nasarawa University,' siri kọwa, e nwere uru na ọghọm dị n'iwu ọhụrụ ahụ ma ọ bụrụ na gọọmenti jichi ego a na-arụaka na ọrịrị ego ọha tupu e bie ikpe ya. Lee ụfọdụ ndị ọ gụpụtara: Uru dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka 1. Ka onye eboro ebubo nrụrụaka gbaa mbọ ka ekpe ikpe ya ngwangwa 2. Ọ ga-ewetu aka etu ndị mmadụ si ezu ego Naijiria 3. Ọ ga-ewelatara gọọmenti ego ha na-emefu ịchụgharị ndị a na-enyo enyo na ha buru ego ọha Ọghọm dị na ya 1. Ndị mmadụ ga-agbagha ya n'ụloikpe si na o megidere iwu Naijiria Ọkaiwu Eze kwuru na ""ọ bụ ihe kwesiri ka ụlọomeiwu Naijiria (National Assembly) kwesiri ime iwu, ọ bụghị 'executive order."" 2. Ọghọm ọzọ bụ na e nwere ike jichie akụ onye aka ya dị ọcha." afirika-43512557,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43512557,Ụzọ ị ga-eji chekwa akara gị na Facebook.,Akụkọ juru mba ụwa bụ na ụlọọrụ Cambridge Analytica na Facebook jiri ozi ọtụtụ ndị mmadụ dị na Facebook eme ndọrọ ndọrọ ntuliaka.,"Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị Nke a butere oke nsogbu na mba ụwa niile dịka ometutara ọtụtụ ndị na-eji Facebook eme otu ihe maọbụ nke ọzọ. Cheta na onye nwe Facebook bụ Mark Zuckerberg arịọla arịrịọ, ebe o kwuru na Facebook mere njeghe. Akụkọ ndị ga-amasị gị: N'ime ọgbaghara ahụ, ndị Cambrige Analytica kwuru na aka ha dị na ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2015. Ha kwuru na otu onye nwere egona Naịjirịa nyere ha ego dị nde dọla abụọ na puku narị asatọ, iji mee ka Jonathan merie na ntuliaka afọ 2015. Ụzọ mgbapụta: N'iji cheekwa akara Facebook gị, onye ọkacha mara n'ihe gbasara technụzụ bụ Opeyemi Olugbemiro kọwara ụfọdụ ụzọ mmadụ ga-eji chekwa onwe ya; Gere ihe o kwuru n'olu bekee: Facebook: Ụzọ ị ga-eji cheekwa Akara gị" afirika-46525966,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46525966,Bianca Ojukwu: Gwanụ Oye rituo n'ọkwa onyeisioche,Ọnụ na-ekwuru ndị APGA n'Anambara steeti bụ Dan Nwafor ekwuola na APGA ga-akwado ihe ọbụla ga-eweghachi udo na pati ha.,"Ojukwu lụrụ Bianca n'afọ 1994 Nwafor kwuru nke a na nzaghachi akụkọ pụtara nke kwuru na Bianca Ojukwu ekwenyela ikpe udo mana ọ gbara isi akwara na ọ bụ naanị ma onyeisioche pati ahụ bụ Victor Oye rituo n'ọkwa ya. ""Na Bianca Ojukwu nabatara ha gosiri n'okwu ahụ na-a ga-ekwute ya ihe. "" Ife ọbụla ga-eme ka APGA gaa n'ihu bụ ihe ga-adị anyị mma"" Ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati APGA gụnyere onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Jerry Chukwueke, onye omeiwu bụ Victor Umeh, John Gbor gara n'ụlọ Ojukwu dị n'Enugwu ịị nwunye ya bụ Bianca ka ọ gbaghara. Obi adịghị Bianca mma kemgbe APGA mechara ntuliaka imeụlọ pati ahụ ebe ọ zọrọ ikike ịnọchị Anambra South n'ụlọomeiwu ukwu na aha APGA nke Nicholas Ukachukwu meriri na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-44098243,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44098243,PFN: Kwụọ ụgwọ gbapụta Leah Sharibu,"Onyeisi otu jịkọrọ ụka ọgba ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ Pentecostal Fellowship of Nigeria (PFN) na bekee bụ Felix Omobude, agwala gọọmenti etiti ka ha kwụọ ụgwọ ma gbapụta Leah Sharibu, nwa Dapchi ndị Boko Haram kpachiri.","N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 100 N'otu aka ahụ, otu jikọrọ ndị otu Kraist mbaụwa a kpọrọ, Christian Solidarity Worldwide (CSW), na bekee ga-amalite ime ka ọha nụrụ olu ha na sochal midia dịka ha na-eti mkpu ka a tọhapụ Leah Sharibu. Cheta na ndị Boko Haram ka ji Leah Sharibu bụ otu n'ime ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110 ndị Dapchị dị na Yobe steeti ha tọọrọ n'ọnwa Februari 19, n'ihi na o kwenyeghị ịjụ Kraịst. Na mkparịtaụka Omobude na ụlọntaakụkọ Punch nwere, ọ kpokuru gọọmenti ka o mee ihe ọbụla dị n'ike ya iji gosi na ọ naghị akpa oke, na ha akwụnyeghịrị Boko haram. Ọ burugodi ịkwụ ụgwọ iji gbapụta ya, ha kwụọ. Ọ sị: ""Ọnọdụ Leah Sharibu a bụrụla nnukwu nsogbu n'ihi na ọ bụrụ na ndị ji ya ekwughị ihe ha jiri kpachie ya, ọ kara ịdị iche ma kwe nghọta. Mana ha were anya kwuo na ihe mere ha jiri jichie ya bụ maka okwukwe ya. Nke a so n'ihe mere ụfọdụ ndị Naijiria na-enyo ya bụ ihe enyo. Kedụ ihe mere na a tọrọ ụmụaka, gbahapụ ha ma jichie otu n'ime ha maka na ọ bụ onye otu Kraist? Ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọ bụla, ihe ọ pụtara bụ na ha nwere ebumnobi nke anyị amabeghị. Ụbọchị ọbụla Leah ka tọrọ na aka ndị ji ya, na-ebute obi mgbalielu n'etiti okperechi dị icheiche na Naijiria. Ana m akpoku gọọmenti ka ha mee ihe ọbụla dị n'ike ha iji gosi na ha anaghị akpa oke, na ha akwụnyeghịrị Boko haram. Ọ bụrụgodi ịkwụ ụgwọ iji gbapụta Leah, ha kwụọ."" Omobude gara n'ihu tụọ arịrị maka oke ogbugbu mmadụ na nsogbu nchekwa dị n'ala anyị ma rịọ gọọmentị na otu APC ka ha mejupụta nkwa 'mgbanwe' ha kwere. N'akwụkwọ ozi nke otu CSW wepụtara nke onyeisi ha na mpaghara Afrịka na Middle-East bụ Khataza Gondwe tinyere aka, otu ahụ kwuru sị, ""Ụbọchị Monde bụ ụbọchị ncheta afọ iri na ise e jiri mụọ Leah, CSW bu n'obi ibido atụmatụ ga-enye aka ka ọụwa nụrụ Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43257527,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43257527,Uru nwaanyị abụghị sọ n'ụsọekwu,Ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'Enugwu steeti akwaala arịrị na anaghị enye ụmụnwaanyị ohere ha nhatanha na nke a na-enye ụmụwoke n'Naijiria.,"Uru nwaanyị abụghị sọ n'ụsọekwu - Ngozi Ugwu Ha kwuru na ọtụtụ ihe na-emebi tata n'ala anyị bụ maka na ọ bụ ụmụnwoke nọkarị n'ọchịchị. Mgbe BBC Igbo gbara ha ajụjụ onu, ụmụnwaanyị si na mpaghara Enugwu steeti gbarụrụ ihu na ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eche na ha adịghị ike. Nke a mere na ha na-emechi ọnụ mgbe a na-emegbu ha n'ụlọọrụ, ụlọakwụkwọ,ezinaụlọ nakwa ebe dị icheiche. Na ụbochị ole na ole na-abianụ, ụmụnwaanyị n'uwa nile gbaa gburu gburu ga-eme mmemme eji echeta ụmụnwaanyị. 0nyeisi otu jikọtara ụmụnwaanyị ndi nta akuko na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria bụ Chibota Edozie gwara ụmụnwaanyị ka ha were ohere mmemme ụbọchị ha nke afọ 2018 wee hụ onwe ha n'anya ma kwado nwaanyị ọbụla chọrọ ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye ode akwụkwọ ndị otu ọrụ n'Enugwu bụ NLC na bekee bụ Comfort Noel Ugomsi kọwara ụmụnwaanyị dịka onu na-ebu isi bụ ụmụnwoke, ọ bụrụ na olu gbajie, isi ga- ada. N'ihi nke a ọ gwara ụmụnwoke ka ha nyochaa, hụ na ebe ọbụla nwaanyị nọ n'isi, mpụ na aghụghọ anaghị adị na ya. Ugomsi jizi ohere a gwa ụmụnwaanyị ka ha hapụ itụ egwu ma teta n'ụra, bia dozie obodo Naijiria. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ gụnyere, Ify Ugwu, Comfort Meife, Ngozi Agbo nakwa Ifeoma Amuta, kwuru na ụmụnwaanyị Naijiria adila nkwadebe ibu ndi isi n' ebe ọbụla dị elu n'ala Naijira dịka ndị ogbo ha na mba ụwa ndị mepere emepe. Ha nyere ụmụnwoke ndụmọoụu ka ha mara na uru nwaanyị bara abụghị sọọsọ n'usọekwu, kama na nwaanyị bu nne, buru odozi ezinaụlọ, buru onye ọzụzụ na nlekọta ọbụladị n'ụlọ ya mana ebe ọbụla ọ nọ na akpata ihe afọ ga-eri. Ụbọchị eji eme mmemme ụmụnwaanyị n'ụwa nile bụ ọnwa Maachị gba abalị asatọ." afirika-44023441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44023441,Awaala Sir Alex Ferguson chịkọtaburu Manchester United ụbụrụ,"Sir Alex Ferguson bụ onye chịkọburu otu Manchester United, na-ezu ike n'ụlọọgwụ ka a wachara ya ụbụrụ maka ọbara na-agba ya n'isi.","Sir Alex Ferguson chịkọtara otu Manchester United site n'afọ 1986 ruo afọ 2013 mgbe ọ lara ezumike nka Ndị otu Manchester United depụtara akụkọ kwuru na ịwa ụbụrụ ahụ gara nke ọma mana Ferguson ""kwesịrị ịnọ n'ime ebe nlekọta pụrụiche (intensive care) nke ga-enyere ya aka ịgbake ọfụma"". Cheta na Ferguson mere ndị na-akwado Man Utd obi aṅụrị ọtụtụ oge site n'iko iri atọ na asatọ (38) o buteere ha n'ime afọ iri abụọ na isii (26) ọ nọ dịka onye nchịkọta ha. Ferguson rituru n'ọchịchị ma laa ezumiike nka n'ọnwa Mee nke afọ 2013. Tupu ọ banye n'ọrịa a mere ka e buga ya ụlọọgwụ, Ferguson pụtara n'ihu igwe mmadụ n'izuụka gara aga oge o nyere onye nchịkọta otu Arsenal bụ Arsene Wenger, ihe nrite iji jaa ya mma ka o kwuru na ọ ga-akwụsị ịchịkọta Arsenal n'afọ ka ọ chịchara ha afọ iri abụọ na abụọ (22). Ihe e kwuru maka Ferguson Ndị United dere na soshal midia na ekpere ha bụ na ọ ga-agbake ọsịsọ. Ụfọdụ ndị ọ chịkọburu oge ọ nọ na Manchester United, tinyere ọnụ na ikpere ya ekpere ka ọ gbakee. David Beckham na Cristiano Ronaldo so na ndị kwuru okwu. Lee ihe ha dere: Ferguson bụ onye nchịkọta kacha mee ọfụma n'ime egwuregwu ndị Britain kemgbe e ji bido ya. O buliri iko Premier League ugboro iri na atọ (13), iko Champions League ugboro abụọ, iko FA ugboro ise na iko League ugboro anọ." afirika-49516994,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49516994,South Africa: Aka akparala ndị uweojii 4 maka ogbugbu onye Naịjirịa na South Africa - Dabiri-Erewa,"Ndị uweojii anọ a na-eche n'aka ha dị n'ọnwụ Pius Abiaziem n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgọst na mba Sawụt Afịrịka nọzị n'aka ndị uweojii, dị ka Abike Dabiri-Erewa siri kwuo.","Odozi akụ Dabiri-Erewa bụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ndị Naịjirịa bi ofesi tinyere ozi na akara Twitter ya. End of Twitter post, 1 Nke a na-abịa ka ndị uweojii nke Sawụt Afịrịka anwụchịela mmadụ iri na asaa ndị aka ha dị na mkpamkpa kpara n'obodo Pretoria ebe ndị mmadụ zuru ohi ma gbaakwa ụlọahia ndị mbiarambia ọkụ. Nsogbu a bidoro n'ụbọchị Wenesde mgbe otu onye a na-eche na ọ bụ onye na-ere ọgwụike gbagburu onye ọkwọ ụgbọala. Ndị otu ndị na-akwọ ụgbọala kwuru na ọbụghị ha bidoro ngagharịiwe a na ihe ọjụọ ndị ọzọ soro ya. Ejirila ikpaoke agwụrụ mara Saut Afrịka Otu onye ọkwọ ụgbọala gwara BBC na ọ bụ onye gburu onye otu ha ka ha na-achọ. O kwukwara sị na ""ndị uweojii soro na-ezu ohi mgbe ogbaaghara na-eme, onweghị ihe ha mere"". Ọ sị : ""Anyị anaghị atụ ndị Naijirịa ụjọ . . . ihe a abụghị maka ikpa oke agwuru"". BBC na Onowu Ezealị Ndubueze Udeji bụ onye so na-ahazị nke ndị Igbo bị na Sawụt Afrịka dịka eze ọdịnanị nwere mkparịta ụka maka mkpamkpa a. Onowu Ezeali kwuru na ọ bụ onye Tanzania na onye ọkwọ ụgbọala nwere nsogbu na Pretoria nke mere ka onye Tanzania gbaguo onye ọkwo ụgboala ahụ. Elisabeth Ndubuisi Chukwu: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Sawụt Afrịka' Nke a mere ka ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka bu ngagharịiwe gaa n'isi ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba ahụ maka oke ohi na ogbugbu a na-egbu ha na Saụt Afrịka. Ọtụtụ n'ime ha sị na e zuchaala ngwaahịa ha niile n'ime mwakpo e mere ha na Wednezde ụbọchị iri abụọ na asatọ ọnwa Ọgọst. NCC chọrọ iri ndị ụlọọrụ ekwentị iwu Mịnịsta na-ahụ maka mkparịtaụka bụ Isa Ali-Pantami afanyela ndị ọrụ ya ọkụ n'ike ka ha nyocha ụlọọrụ nzikọrịta ozi n'ekwentị maka oke data ha na-amịpụ n'ekwentị ndị mmadụ Pantami dịka ọ malitere ọrụ ya n'uju sị na e kwesiri iri ụlọọrụ ndị a iwu maka mkpesa ndị mmadụ na-enye akarịala. N'egwuregwu Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falconets a maburula ọlaedo n'egwuregwu zuru mba Afrịka ọnụ site n'iji penariti ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Kameruun. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-48162676,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48162676,JAMB UTME: Etu Jamb ji nwụchie ndị 'gbara mgbọ' n'ule,Ụlọọrụ na-ahụ maka ule eji aba mahadum bụ JAMB ewepụtala aha ọgbọ ule dị 76 bụ ndị ha sị mere nrụrụaka n'ụle ha nke afọ a.,Ha kpọpụtara aha ọgbọ ule ndị a dịka ha nyere onye ọkaikpe ikike ikpe ụmụakwụkwọ ruru otu narị so mee nrụrụaka n'ule elere n'etiti ụbọchị iri na otu na iri na asatọ nke ọnwa Eprelụ ikpe. Onye na-ahụ maka ndebanye aha n'ụlọọrụ ahụ bụ Is-haq Oloyede kwuru nke a na Fraịde n'ọgbakọ agụmakwụkwọ nke afọ a emere n'Abuja. Ụlọọrụ JAMB kwuru na ndị ọrụ nchekwa 'Civil Defence' na ndị uweojii nwuchiri ihe ruru mmadụ otu narị na Naịjirịa gbaa gburugburu n'oge ule a. Oloyede kọwara na ọ bụ site n'ihe onyonyo CCTV ka eji chọpụta ndị mere nrụrụaka n'ụfọdụ ọgbọ ule a. Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum O kwuru na ụfọdụ ndị bịara ilere ndị mmadụ ule zoro n'ime ụlọ mposi ma pụta nọchie anya ụfọdụ ndị ha bịara ilere ule a dịka ha gara ime mposi. Oloyede kwuru na ihe karịrị mmadụ otu narị nọ n'ime ụlọ mkpọrọ dị iche iche na Naịjirịa ugbua na-eche mgbe a ga-ekpe ha ikpe. O kwuru na ọgbọ ule 76 ewepụtara aha ha so n'ime ọgbọ ule dị 741 ndị tinyere aha ha maka ule JAMB nke afọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-47924985,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47924985,"Chibok Girls: Ihe mere nne na nna ji etinye uche n'aka 'ụkọchụkwụ ọrụ ebụbe""","N'atụmatụ odee anyị nke ndị ntaakụkọ si Afịrịka na-eweta, Adaobi Tricia Nwaubani sị na nne na nna ụmụ akwụkwọ na-efu na Chibok ka nwere olilanya ka afọ ise gachara kemgbe atọọrọ ha.","Obi ka na-amafụ nne na nna ụmụ akwụkwụ Chibok n'aka ihe atụghị anya, abụghị Boko Haram, nwereike nọrọ na nsogbu niile ha nwere kemgbe afọ ise gara aga atọọrọ ụmụ ha n'ụlọ akwụkwọ ha n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa. N'ime ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 200 atọọrọ n'ime ulọakwụkwọ ha n'ụbọchị Apreelu nke 2014, 107 alọtara site na-ịtọghapụ maọbụ nkwekọrịta gọọmentị Naịjirịa na Boko Haram nwere, ka ihe karịrị 100 ka na-efụ. Yakubu Nkeki, bụ onyeisioche otu nne na nna ụmụ ya so n'ime ndi aka ji sị; ""Onwere ihe na-achụ anyị, n'ụzọ ọbụla eji loo ya,"" Nwa nwanne Nkeki so n'ime ụmụakwụkwọ atụghapụrụ n'afọ 2017. Mr Nkeki nwere ọtụtụ mgbawa obi oji agba akaebe ihe a ọ na-elo. N'ọnwa Epreelu nke 2018, nne na nna ụfọdụ umụ akwụkwọ a atụghapụrụ dabanyere na mberede okporo ụzọ. Ha nọ na njem ịga nzukọ na mahadum di na Yola ebe ụmụ ya nọ na-eme mmụta pụrụiche gọọmentị haziri. Otu n'ime ha nwụrụ ebe ahụ ebe 17 ọzọ gara ụlọ ọgwụ maka mmerụ ahụ ha nwetere. N'ọnwa Janụwarị nke afọ a, ụmụ nne 18 ụmụ Chibok ka na-efu na-alaghachi ụlọ akwụkwọ ha mgbe ụgbọala bu ha nwere mberede. Mmadụ asaa n'ime ha nwetere ezigbote mmerụahụ. Onye ọzọ merụrụ ahụ bụ Zannah Lawan, onye odeakwụkwọ otu nne na nna ụmụ Chibok. Lawan du umụakwa ahu aga akwụkwọ. Ọsụkọsụ na-agbalite N'ọnwa Maach, mgbe ụmụaka ahụ na-alaghachi akwụkwọ, Nkeki kpọ ha ga, busa ha n'ụlọakwụkwọ, mana ụgbọala ahụ oji ala nwere mberede n'ụzọ. Ọ sị; ""Ụgbọala tụgharịrị mana emerụghịm ahụ,"" ma sịka, ""Ihe ndị a agbaghị aka."" Rifkatu Galang, onye atọọrọ mgbe ọ dị afọ 17 n Chibok ka nọkwa n'aka ndị ntọọrị MMdu 34 so n'otu nne na nna Chibok anwụọla kemgbe atọọrọ ụmụ ha ruo ugbua, site na mberede okoro ụzọ, ọrịa nakwa mwakpo Boko Haram. Ihe ọzụ na amapụ Maazị Nkeki obi bụ esemokwu na-ada n'etiti nne na nna umu Chibok. Nzukọ ha na ejikarị esemokwu gbasaa, ka nne na nna na-achụ ịgba ibe ha ọgụ. N'afọ gara aga, ụfọdụ nne na nna ụmụ Chibok a na-efu kwuru na ha ga-agbachi ụzọ ụgbọala bu ụmụ aka ndi atụghapụrụ laghachi Yola, na Mahadum Amerịka nke Naịjirịa, ka ha mechara ezumike. Nne na nna ndị a na-eche na ntụghapụ a atughapụru ụmụaka ndị a mere ka ewepụ yche n'ụmu ha ka no n'aka ndị Boko Haram. ""Anaghị m achọ ịkpọ ha niile na nzukọ otu mgbe,"" Maazị Nkeki sị. ""A na-ahọta ndi nke nwereike ige ntị ọfụma ma zie ndị ọzọ ozi."" Ka nke a na-eme, ụjọ banyere mwakpo Boko Haram ka bụ ihe ndị Chibok na-eche maka, agbanyeghi na ndị agha . Ndị ofufe alakuba na ndị Kraịst bi na Chibok. N'izu ụka gara aga sọsọ, Boko Haram gbara obodo asaa ọkụ na mpaghara ahụ ma mebie ọtụtụ ụlọ, tumadị nke ụfọdụ ụmụ Chibok a na-agụ akwụkwọ na mahadum na Yola. Ụfọdụ ụmụ Chibok na-agụ akwụkwụ pụrụiche na Mahum Amerịka dị na Yola Maazi Nkeki sị, ""Ihe a na-eme na Chibok jọgbụrụ onwe ya."" Ọ sịkwa, ""Ọtụtụ mmadụ anọghịzi na be ha."" Nne na nna Chibok na-ahụzị ntọrị ụmụ ha ka otu n'ime ajọ ihe dakwasịrị ha na obodo ha. Ịchọ ọrụ ebube Maka ncheta ntọrị umụaka a nke ise, ha kpebiri ịga n'ụzọ ọgwụgwọ nsọ. TB Joshua bụ ụkọchukwu ama ama Na mbido ọnwa, ndị na-anọchite anya otu nne na nna Chibok gara njem karịrị elekere 48 n'okporo ụzọ site Chibok gawa Legọs, ịga hụ ụkọchukwu ama ama bụ TB Joshua. Nwoke hibere ụlọụka akpọrọ ""The Synagogue, Church of All Nations (SCOAN) na Bekee so n'ime ndị ụkọchụkwu aha ha na-ada ụda na Naịjirịa. Puku kwa puku mmadụ na-esi ụwa dum abịa ụlọụkwa SCOAN dị na Ikotun dị na Legọs ịchọ ọrụ ebube. Yana Galang, otu n'ime nne na nna 12 gara SCOAN sị; ""Ihe mere anyi jiri kpebie ị ga hụ ya bụ makana anyi ahụla ọrụ ministri na-ahu maka ụmụ nwaayị, gọọmentị etiti na ọtụtụ mmadụ, mana ruo oge a, enweghi akukọ maka ụmụaka no n'ọhịa."" Nwa Galang, Rifkatu, ka no na-aka Boko Haram. ""Onweghi onye bịara gwa anyi ihe ọbụla maka umụaka a. Ọ ya mere anyị jiri wetere ya Chukwu."" N'ime ndị so gaa Legos bụ onye nnekọta Leah Sharibu, bụ nwata dị afọ 14 so n'ime ihe karịrị umụakwụkwọ 100 ndị Boko Hatam tọọrọ n'afọ 2017 n'obodo Dapchi. Ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ atọọrọ mgbe atọọrọ Sharibu nwụrụ mgbe Boko Haram nwụchịkọrọ ha, mana atụghapụrụ ndị ọzọ ka gọọmentị Naịjirịa na ndị ji ha nwere nkwekọrịta. A ka ji Leah, makana okweghi na ya ga-agbara ikpe ofufe Kraịst azụ site ịbụrụ onye alakuba. Agbanyeghi nkwa gọọmentị na-ekwe maka ntụghapu nwaada a, ọ nọ n'ime ntọọrị mee ncheta afọ 15 ya. Nne na nna ya ejighi ahụ ugbua, nke mere ha ji zipu nwanne ya ka ọ ga nọchite anya ha na nzukọ a emere n'ụka TB Joshua. Ọnu na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na a ka na-agba mbo ịkpọlata ndị a aka ji, mana ọgbahara di n'etiti Boko Haram so me ka ọrịa ahụ. Ọ sị na otu n'ime Boko Haram na-akpa agwa ekwie ekwe. Ma Nkeki kwenyere na gọọmentị agbasiela mbọ ike. Ọ sị; ""Ndị agha agbaala mbọ ha dịka ọtụtụ n'ime ha anwụọla ka ha na-achọ ụmụ anyị maọbụ ichekwa anyị.""The military have tried their best and many have lost their lives while looking for our daughters or trying to protect us,"" Mana, ọsikwa na nne na nna ụmụaka chọrọ ka asaa ha ajuju ha banyere etu ihe si kwụrụ. ""Anyi kpebiri ị bịa nke TB Joshua makana anyị na-ahụ ya na TV nakwa na-ahụ etu o si eme ihe ebube ma na-enyere ndi mmadu aka. Ya bụrụ na ihe a na-eme anyi si anyi na-aka, ya pere anyi ekpere.""" afirika-45646410,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45646410,Buhari ekwusiela ike na gọmenti ya kwadoro SDG,"N'ụbọchi Tuzde ka onyeisiala Mohammadu Buhari kweghariri nkwa maka ịmezụ atụmatụ ""sustainable development goal"", akpọrọ SDG n'aha ịchafụ.","Muhammadu Buhari gara Ọgbakọ UN Mkpebị a dị n'akwụkwọ ozi Onyeisisla a dere maka nchete ya bụ nkwa ndị mbaụwa kwere maka mmepe uwa nile gba gburugburu ọkachasị ndị ogbenye ọnụ ntụ. N'akwụkwọ ahụ nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Femi Adesina gụpụtara, Buhari sị na ""dịka ncheta ụbọchị tata ejiri hibe atụmatụ a siri dịrị, ana m ekwesi nkwa ike na ịhụ maka ọganihụ, udo nakwa nchekwa nke ụwa ịhụ na-ọnweghị nwananyị, nwoke, agbọghọ maọbụ okoro a ga-ahapụ"". Okwukwara na dịka mba nwere uchu na mmepe obodo na ""Naịjirịa ga-esonye ndị mbaụwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu nke gụnyere United Nations, ndị abụghị ndị ọrụ gọmenti kwụrụ onwe ha akpọrọ ""NGOs"" na aha ịchafụ nakwa ndị okpokpo akwụkwọ ndị ọzọ ịhụ na-emejuputara SDG"". Okwukwara na "" ha kwenyesiri ike na amụma i si na gọmenti fere na gọmenti ọzọ nke Naịjirịa nakwa amụma ịwehachite akụ na ụba na ọganihu Naịjrịa."" Buhari sị na atụmatụ SDG nyere ohere ị me ka achụọ agụ na ụbịam ọsọ ọkpa erụala ma bụtekwa ọga n'iru tọrọ atọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54663586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54663586,EndSARS: Akụkọ ụgha so ngagharịiwe ahụ pụta,"Ngagharịiwe malitere na mbido ọnwa a na Naịjirịa dika ndị mmadụ na-akpọ gọọmentị oku ka ọ kagbuo ngalaba ndị uweojii a kpọrọ ""Special Anti-Robbery Squad"" (SARS).","Akụkọ atụmatụ a malitere iwu n'ụwa dum, dịka puku kwa puku akụkọ maka ya pụtara na soshal midia, mana ọ bụghị ha niile bụ eziokwu.Anyị tinyere anya n'ụfọdụ akụkọ ụgha metụtara ngagharịiwe a etinyere n'ịntanetị. Nwa ada ndị uweojii gburu ụmụnne ya nwokeFoto na-emetu n'obi nke otu nwaànyị aha ya bụ Ugwu Blessing Ugochukwu n'ebe ọ na-ebe akwa dịka o ji ọkọrọtọ Naịjirịa, ma makwuru n'elu akpụrụakụ wuru ewu na Twitter. Foto a bụ eziokwu dịka e sere ya oge nwa ada sonyere ngagahrịiwe e mere n'Enugwu. Mana, dịka a na-eke foto ahụ, ndị mmadụ malitere itinye akụkọ ụgha na ya.""Ọ bụghị otu nwanne...3...n'otu ụbọchị...ka e gburu tụnye n'ime weelu,"" bụ ihe otu onye dere na foto ahụ ekwesara ọfụma na soshal midia, dịka a na-akọwa na ndị uweojii gburu ụmụnne ya. Mana Gideon Obianime bụ onye na-ekwuru Ugochukwu, gwara anyị na nke ahụ abụghị eziokwu.Ọ sị na ndi Sars nwuchiri nwaànyị ahụ n'afo 2018 mana onweghi nwanne ya ha gburu. ""Ọ bụ ndị mmadụ na-etinye akụkọ ndị a nafoto ahụ. Ọ na-ebutere ya ilo ugbua.""Ndi agha agaghị awakpo gị ma ijide ọkọrọtọ Naịjirịa Akukọ amabeghị ma ọ bụ eziokwu wuru ewu ọfụma - na onye agha agaghị agba onye ji ọkọrọtọ Naịjirịa egbe. Ekesara atụmatu a ọfụma na Twitter, Facebook nakwa Instagram, dịka ụfọdụ na-ekwu na ọbụ usoro ndị agha Naịjirịa. Ọ bụ na foto esere mkparịtaụka mmadụ abụọ nwere ka akụkọ a si pụta. N'ime akụkọ ahụ, otu onye gwara onye ọzọ na ọ bụ nna ya bụ onye agha gara ezumike nka gwara ya. Otu onye n'ime ndị na-akparịta ụka ahụ sị ka ekesaa ya ka ndị na-enme ngagharịiwe hụ ya. Enweghị aka ebe ma ncha na ihe a bụ eziokwu. Ụfọdụ n'ime ndị kere ya ewepụla ya dịka ndị mmadụ gwara ha na ọ bụghị eziokwu. Onyekachi Umah bụ onye ọkaiwu gwara BBC na enwere iwu maka ịkwanyere ọkọrọtọ Naịjirịa ugwu, ma sịkwa: ""Na mmadụ ji ọkọrọtọ Naịjirịa abụghị na ndị agha agaghị eme ihe ha chọrọ ime."" Anyi jụru ndị agha maka ihe a, mana ha asabeghi.O nweghị onyeisi Naịjirịa sị na ngagharịiwe a na-eme bụ ihe ụmụaka Ka ngagharịiwe a malitere otu ihe onyonyo e tnyere na soshal midia gosiri otu onye ndụmọdụ Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina ebe ọ dị ka ọ na-asị na ndị na-eme ngagharịiwe na-eme ""ihe ụmụaka"". Ndị mmadụ malitere ikesa ihe onyonyo ahụ, were na-ekwu na ""ya bụrụ na ị naghị iwe iwe ọfụma, ihe onyonyo a ga-enyere gi aka."" Mana ihe onyonyo ahu bụ nke ochie, ma bụrụkwa ihe achabiri, nke gbanwere nghọta ha. Onweghi ihe ọbụla gbasara ihe nyonyo ahụ na okwu Sars. N'oge ahụ, Adesina nọ Televison ekwu maka ngagharịiwe. Mana a chabiri ihe onyonyo e tinyere na Twitter were wepụ mbido okwu ya ga-akọwa ihe ọ na-ekwu ọfụma. Channels TV, bụ ụlọ ntaakụkọ ọ bụ akụkọ ha ka emere nchabi a ekwuola okwu banyere ya ma kọwa ya ọfụma." 44231795,https://www.bbc.com/igbo/44231795,"Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ma Olisa Metuh anọ ya ma ọnọghị, ikpe ya ga-aga n'ihu",Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a :,"Olisah Metuh anọ ya ma ọ nọghị ya, ikpe ya ga-aga n'ihu. Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ Nke a bụ maka na Ụlọikpe etiti n'Abuja enyela ndị EFCC ikike ịnwale ya n'azụ ya. Metuh bụbu onye nkwuchiteọnụ ndị PDP na-aza ọnụ ya n'ebubo gururu asaa maka ego nde narị naịra anọ ọ natara ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa obodo n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan. Naịjirịa Onyeisi ndị na-arụrụ obodo ọrụ a na-akpọ 'Civil Service' na Bekee bụ Winifred Oyo-Ita kwuru ka e nyochagharịa ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ. O kwuru na nke a ga-eme ka ndị ọrụ na-etinye uchu n'ọrụ ha. Akụkọ mba ofesi Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla maka Ebola na kongo. Ụmụnne ndị ahụ nwụrụ gara kpọpụta ha ebe e kewapụrụ ha kpọrọ ha gaa n'ụlọụka ka e kpere ha ekpere. Nwaanyị mere nwa ya n'ike ịlụ di agala nga A tụrụ otu nwaanyị na mba UK nga afọ anọ n'ọma taa. Maka na o manyere nwa ya nwaanyị n'ike lụọ nwanne ha nwoke ji ọtụtụ afọ tọpịa ya. N'egwuregwu, Kemgbe afọ 22, onye ọhụrụ na-akụzizi otu egwu bọọlụ Arsenal Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Unai Omery ewerela oche ma mee ọgbakọ mbụ nke ya na ndị ntaakụkọ taa. O kwuru na ya agaghị ekwe nkwa na ha ga-emeri mana ha ga-ejikọ aka ọnụ rụọ ọrụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Enwere m nti eji ama egwu ga-aga ahia' -Honesty Music" afirika-53616674,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53616674,"Igbo reincarnation : Ịlọụwa, agwụ Ọgbanje na nkwenye dị ọzọ ndị Igbo nwere gbasara ọnwụ na ndụ","Ịlọụwa bụ nkwenye ndị Igbo nwere na mmadụ nwụọ, ọ ga-alaghịkwa ụwa ọzọ iji nara ụgwọ ụdị ndụ o biri mbụ.","Onye na-agba afa Ihe nke a pụtara bụ na ndị Igbo kwenyere na mmadụ nwụọ, ọ naghị ebi ebe ahụ. N'omenala Igbo, a na-ahụ ịlọụwa dịka onye nwụọrọla isi n'alamụọ, ebe ndị nna ochie nọ, lọghachị n'ụwa ,a mụọ ya ọzọ. Ịlọụwa dabere na nkwenye ha n'ọnwụ nakwa ndụ nakwa n'ụwa a na-ahụ anya na alamụọ anaghị ahụ anya dị. Igbo na-ewe ya na mmadụ nwụọ, okwu ebighị kama onye ahụ ga-agafe n'ala mmụọ, n'ala ndị ochie, ebe ọ ga-esi lọghachị ọzọ n'ala ndị dị ndụ. Dịka otu onye omenala Igbo were anya bụ Nze Duruagwu Ukaejuoha, siri kọwaa, ""mmadụ na-alọ ụwa iji bịa mezie ihe ndị o mebiri emebi, ịta ahụhụ ihe o mere mgbe ochie maọbụ ịbịa rie uru maka ihe ọma o mere n'ụwa ya mbụ."" ""Ọ bụrụ na mmadụ abụrụ onye ọjọọ, Chukwu Okike ga-ahaziri ha ọlọ ụwa ha ka ha nọdụ n'ọnọdụ ahụhụ nke na ha agaghị ahụ ego gaa ụlọọgwụ."" Duruagwụ Olueze: Ndị iche dị n' ịlọụwa,ọgbanje na agwụ N'otu aka ahụ, onye omenala Igbo ọzọ nụ Mcginger Ibeneme kọwara na ọ bụ nkwenye a na ihe onye metara, ọ ga-ala gị taa ahụhụ ya (nke Bekee kpọrọ Karma) mere ndị Igbo ji agbara ajọ ihe ọsọ. ""Igbo na-akpọ ya 'ọdịnaobi'."" ""Ọ bụrụ na nna gị mere ajọ ihe dịka na ọ na-egbu mmadụ maọbụ na-ezu ohi, dịka Akwụkwọ Nso si ekwu na njọ nna mere n'ụmụ ya. E nwere ezinaụlọ ị ga- apụta a na-anwụ ọnwụ Ike."" Ukaejuoha kwuru na mmadụ na-esi n'ebe dị iche iche alọ ụwa: mmiri, anyanwụ,elu, ala na arụsị. ""Ya mere e ji nwee Ezenwaanyị mmiri maọbụ eze mmiri (mamiwọta)."" Ọ bụghị naanị Igbo nwere nkwenye n' ịlọụwa, ofufe ndị ọzọ dịka ndị Hindu, ndị Budha nakwa ndị ụka Kraịst kwenyere na ndụ ebighị n' ọnwụ. Iji maa atụ: Ndị otu Kraịst nwere nkwenye na Kraịst bụ mmụọ (Chukwu) lọrọ ụwa a mụọ ya ka mmadụ, ọ nwụọ dịka ha na- ele anya na ọ ga- alọghachi azụ n' ụwa ọzọ dịka e so depụta ya n'Akwụkwọ Nso(John 5:58, Phil2:5-8) Njirimara ịlọuwa E nwekwara ihe Igbo na-ahụ dịka ihe na-arụtụ aka n' ịlọụwa maọbụ onye lọrọ ụwa. Ha gụnyere: Nwata iwe akara maọbụ apa dị na ahụ onye ezinụlọ ha nwụrụla; nwata inwe amamihe karịrị nke ọgbọ (ebibiụwa) maọbụ mara ekwu okwu dịka okenye; nwata nwere àgwà okenye; nwata inwe ike ịkọ ihe merela tupu a mụọ ya, DGZ. ""Ohi dị na agbụrụ, ajọ ihe dị iche iche dị n' agbụrụ."" Ịlọụwa dị na ndabere, na ndabere. Ọgbanje, agwụ, ndị ichie, mamịwọta(ezenwaanyị mmiri nakwa Eze mmiri) bụcha ndabere gbadoro ụkwụ n' ịlọụwa. Lee etu Ukaejuoha na Dkta Ibeneme siri kọwa ụfọdụ n'ime ha: Ọgbanje Ndị agbara Ezenwaanyị na-efe Imo Awka, na-agbara ya egwu mmụọ bụ Opu-Eke iji kelee ya maka onyinye o nyere ha Dịka ndị o doro anya siri kọwaa, ọgbanje bụ ụdịrị ịlọụwa. Nwata bịa ụwa, ọ gaghị anọ anọ ya anwụọ. Ukaejuoha sị na "" ọgbanje bụ otu a na-abanye n'ụwa na abụghị ụwa nke a. Ọgbaje na-abịa were ahụ mmadụ, ha na-enwe mkpebi ihe ha na-achọ ịrụ ma na-anwụ ọnwụ mgbabiri"". ""Ọgbanje na-agbabiri nwụọ. Ọ bịakwa ọzọ, ọ ga-emekwa ihe onye ọ lọrọ ụwa mere. Ọ gara n'ihu kọwaa na ọgbanye were ike ịbịa ugboro ugboro iji taa nne na nna ya ahụhụ. Ibereme kwuru na ""ọgbaje bụ agwụ nwaanyị'. Ukaejuoha kọwaa na e nwere ezigbo ọgbanje, nwee ajọ ọgbanje. Ọ sịkwa na ọ bụ a kpọrọ, ""ezenwaanyị""bụ ọgbanje nwere onyinye pụrụ iche nwere ike ịgwọ nwata ọgbanje na-enye nsogbu. Agwụ Nwaekemezie Onwudinjo, Aka na-akụ Opu-Eke na mmemme Imo Awka. Agwụ, dịka Nze Olueze siri kọwaa ya bụ ""mụọ na-ahụ maka isibie elele(magic), ibu amụma(prophecy), ịhụ ụzọ( divination) ọgwụ na ǹkà pụrụ iche."" Mcginger na onye agwụ mara nwere ike ị na-ahụ ụzọ.maọbụ nwee nka pụrụ iche nke ọ na- eme ya karịchaa ndị ogbo ya pụọ iche. Nze Ukaejuoha rụtụrụ aka na ""O nweghị arụsị n'Igbo ga-akwudo na enweghị agwụ."" Ọ gara n' ịhụ kwuo na ""nwoke ọbụla nwere agwụ"" mana ha na- apụta ihe n'ụdị nakwa oge dị iche iche. Ọ sị, ""Ihe ụwa dị na nkatụ, na nkatụ."" ""Etu ihu di iche iche, ka amara ọ na-anata Chukwu Okike Abịama."" O kwuru n'ụfọdụ hapụ ime ihe agwụ ha dere ha ime nwere ike ime onye ahụ ara maọbụ bute ndụ abaghị uru. Nkwenye Ịlọụwa na Sayensị Mcginger Ibeneme bụ dọkịta ahụike ma bụrụkwa onye ihe omenala doro anya Ibeneme onye bụkwa dibia Bekee kọwara na dika ịlọụwa bụ ihe miri emi, na Sayensị bụkwa ihe miri emi kama na ndịiche dị na ya bụ na ndị Bekee deturu nke ha ma gbaa ya n'anwụ, ebe Igbo emeghị otu ahụ. N' okwu agwụ, ọ kọwara na ndị mmadụ nwere onyinye maọbụ nka enweghị oyiri dịka otiegwu a ma ama bụ Tupac na onye ihe eserese a ma ama bụ Picaso bụ ndị agwụ. N'okwu ịkpọ ọrịa okponaọbara(Sickle cell), ọgbanje, dkta Ibeneme sị na ""Ọrịa Sickle cell abụghị ọgbanje,"" kama ọ bụ nghọtahie ụdị ọbara nwoke na nwaanyị nwere. O kwuru na oge gboo, iji gbalahụ ọnwụ nwa ọhụrụ, tupu nwoke na nwaanyị alụọ, na a na- ajụ ese. ""Afa nwere ike kwuo na ha agaghị alụnwu onwe ha, na ezinaụlọ lụkọọ, na nwa ha na-anwụkarị."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49830085,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49830085,Boko Haram egbuola onye ọrụ enyemaka,Otu ngalaba Boko Haram a kpọrọ 'Islamic State West Africa Province' egbuola otu onye ọrụ enyemaka ha tọọrọ.,"Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ N'ozi otu a kpọrọ 'International charity Action Against Hunger' wepụtara kwuru na onye a e gburu so n'ime mmadụ isii ndị Boko Haram tọọrọ n'ọnwa Julaị 2019. A matabeghi aha onye ọrụ enyemaka ahụ e gburu ma ọ bụ kwanụ onye ọrụ ndị otu 'Action Against Hunger' n'ezie. N'ọnwa Julaị, a tọọrọ otu onye ọrụ nlekọta, ndị ọkwọụgbọala abụọ na ndị ọrụ mịnịstrị ahụike mmadụ atọ na Borno Steeti. Ogbugbu a na-abịa n'ime otu izuụka ndịagha mechiri otu ụlọọrụ nlekọta dị na Maiduguri ma kwuo na ha na ndị Boko Haram na-arụkọ. Ụlọọrụ a kpọrọ Mercy Corps kwuru n'ụbọchị Wednezde na ndịagha Naịjirịa mechiri ụlọọrụ ha nke mere ha agaghị arụ ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46854673,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46854673,2019 Election: Rochas o ji otu ụkwụ nọrọ n'APC?,"""Ọ bụ nwa m Uche Nwosu nọ na pati Action Alliance ga-achị Imo steeti.""","Akụkọ dị mkpa ""Mba ọ bụ Hope Uzodimma nke APC ga-azọta oche gọvanọ n'Imo steeti."" Ndọrọndọrọ a mere n'etiti nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari nakwa Rochas Okorocha mgbe nwunye osote onyeisiala Dolapo Osinbajo nọchịtere anya Aisha nakwa ndị otu pati APC ngalaba ụmụnwaanyị na ụmụ ntoroọbịa gara ịchụ nta vootu na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde gara aga. Ihe ndị ọzọ mere ebe ahụ: Obiano kwụsị ịkwadọ nghọpụtagharị Buhari - Atiku-Obi Campaign Organisation Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Otu kpọrọ onwe ha Atiku-Obi Campaign Organisation adọọla gọvanọ Anambra Steeti bụ Willie Obianọ ka ọkwụsị ịna chụrụ onyeisiala Buhari nta vootu. Onyeisi ha bụ Harry Oranezi kwuru n'ozi owepụtara kwuru na nke a megidere ebumnobi ndị Igbo gbaa gburugburu. Anyị achọpụtala ndị ozi Boko Haram - Ndịagha Naịjirịa Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ụfọdụ ndị na-ere nkụ na Borno Steeti na-enyere ndị Boko Haram aka site n'izigara ha nri, ọgwụ mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ. Onye ndu ndị nke ngalaba 7 Division bụ Brig. Gen Bulama Biu kwuru nke a mgbe ọ na-azụ ajụjụ banyere mmachi ha machiri ndị na-ere nkụ n'ogbe ahụ. N'ofesi Ihe ruru mmadụ anọ anwụola site na mgbawa mmansụ gaasị bụ nke mere n'etiti obodo Paris dịka ndị ọrụ gbatagbata chọpụtara ozu otu nwaanyị. Ọkụ ọgbụgba a gbukwara ndị na-agbanyụ ọkụ mmadụ abụọ ebe ọtụtụ merụrụ ahụ gụnyere okporoụzọ na ngwongwo lara n'iyi. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Traditional Retirement:'Ịgba Ọtaọmụ bụ ihe anyị emepe obodo' - Ndị Amaekpu Ohafia N'ofesi, Aka na-achị South Afirika bụ Cyril Ramaphosa arịọla ụmụnwoke ka ha jịkọta aka kwụsị oke mmetọ ahụ na-eme na mba ahụ makana ọ bụrụla nnukwu nsogbu. Ebe, Odee akwụkwọ Mba U.S bụ Mike Pompeo kwuru na a ga-enweli nkwekọrịta n'etiti Amerika na Turkey iji wee chekwa ndị ọgụ Kurdish na-alụ ọgụ na Syria ka Amerika pụchara na mba ahụ. N'egwuregwu, Asọmpi Naịjirịa Professional Football League ga-amalite taa bụ Janụary iri na atọ, 2019. Kwara united ga-ezute Sunshine stars ebe MFM fc ga-ezute Eyimba FC n'ọgbọ egwuregwu ọhụrụ Eyimba dị n'Aba. Nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50967438,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50967438,Igbo Entrepreneurs: Ụmụafọ Igbo iri bụ 'entrepreneur' kajara akaja,"Dịka a na-ekwu na ndị Igbo bụ ndị e ji ịzụ ahịa wee mara, lee ụfọdụ ndị Igbo ma nke ha riri gbasara iji ego achụ ego nakwa ikepụta ọrụ n'ala Naịjirịa.","Ịgba mbọ abụghị ihe na-atụ ndị Igbo ụjọ, mana e nwere ndị aha ha ka nke ndị ọzọ ada ụda, na ndị kpatarala akụ na-enye ndị ọzọ ohere ịkpata akụ nke ha. Ndị a bụ ndị bekee na-akpọ 'Industrialists'. 1) Innoson Group - Innocent Ifediaso Chukwuma Innocent Chukwuma Chukwuma bụ onyeisi ụlọọrụ Innoson Group. Chukwuma bụ onye Ụmụdim nke dị na Nnewi, Anambara steeti. O bidoro iji aha Innoson Group azụ ahịa n'afọ 1981. Ihe Innoson Group na-emepụta gụnyere: 2) IBETO Group - Cletus M. Ibeto Mazi Cletus Madubugwu Ibeto bụkwa nwaafọ Nnewi nke dị n'Anambara steeti a ma ama dịka oji ego achụ ego. A mụrụ ya n'afọ 1952. O bidoro dịka ọkwọụgbọala na onye na-arụzi ụgbọala. Ibeto gbaara Lawrence Amazu nke nwe 'Chidiebere Transport Company' odibo tupu o bidozie nke ya. Ihe IBETO na-eme gụnyere: 3) Chicason Group - Alexander Chika Okafor Alex Chika Okafor Onyeisi ụlọọrụ Chicason Group Alexander Chika Okafor bụ onyeisi ụloorụ Chicason Group nke dị na Nnewi, Anambra steeti. Ọ bụ onye Ụmụdim, Nnewi, Anambara steeti. Ọ bụ n'afọ 1981 ka o bidoro ịzụ ahịa. Ihe ChicasonGroup na-eme gụnyere: 4) Erisco Foods Limited - Mazi Eric Umeofia Umeofia bụ onyeisi 'Erisco Foods Limited'. Ọ bụ onye Amichi nke dị n'okpuruọchịchị Nnewi Saụt, Anambara steeti. O bidoro ịzụ ahịa akụrụngwa ụgbọala n'afọ 1983 na Sokoto. Ọgbambọ: Ị ma Erisco? Lee ka N4200 sị mụtara ya ụlọ mmepụta tomato kachasị n'Afịrịka Umeofia bụ onye ọ na-amasị inyere ndị mmadu aka. Ihe Erisco Foods Limited na-eme Ihe e jiri mara ụlọọrụ Erisco bụ: 5) Coscharis Group - Cosmas Maduka Onyeisi ndị ụloọrụ Coscharis Group bụ Cosmas Maduka bụ nwaafọ Nnewi nke dị n'Anambara steeti. A mụrụ ya n'afọ 1958 n'obodo Jọs dị na Platu steeti. O bịdoro ịzụ ahịa mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Ọ bụ n'afọ 1977 ka o bidoro ụloọrụ Coscharis site n'ire akụrụngwa ụgbọala. Ihe Coscharis Group na-eme 6) Airpeace - Allen Onyema Allen Onyema bụ onyeisi ụlọọrụ Airpeace Mazi Allen Onyema bụ ọnye obodo Mbọsị nke Ihiala dị n'Anambara Steeti. A mụrụ ya n'afọ 1964 na Bini dị n'Edo steeti. Ọ bụ onye ọkaiwu tupu ọ malite ụlọọrụ 'Air Peace' n'afọ 2013. Ihe Airpeace na-eme Airpeace bụ ụlọọrụ njem ụgbọelu. 7) Kotec Group of Companies - Chika Emenike A mụrụ Chika Emenike onye bụ onyeisi 'Kotec Group' na 'Tummy Tummy noodles' n'afọ 1969 n'Amanatọ Ụzụakọlị dị n'Uruala, Ideatọ nke Imo steeti. Ọ bụ site n'ire akụrụngwa ọgbatumtum ka o si bido ịzụ ahịa ndị ọzọ. Ihe Kotec na TummyTummy na-eme 8) Loius Carter - Louis Onwugbenu Mazị louis Onwugbenu bụ onyeisi ụlọọrụ Louis Carter bụ nwaafọ Uruagụ Nnewi, Anambara steeti. A mụrụ ya n'afọ 1953. Ihe Louis Carter Group na-eme 9) Orange Group - Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna Mazi Tony Ifeanyichukwu Ezenna bụ onye Akọkwa nke Ideato, Imo steeti. A mụru ya n'afọ 1957. O bụ n'afọ 1988 ka 'Orange Drugs' bidoro ọrụ. Ihe Orange Group na-eme 10) Emzor Pharmaceuticals - Stella Chinyelu Okoli O nwetala nturuugo Officer of the Order of the Niger, OON nakwa Member of Order of Nigeria, MON Stella Okoli bụ onye Nnewi dị n'Anambara steeti. O so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ahụike na Naịjirịa. A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị nke afọ 1944. Ọ bụ n'afọ 1977 ka ọ malitere Emzor Pharmaceuticals dịka kemist. Ihe Emzor Pharmaceuticals na-emepụta: Ndị a edepụtara ebe a abụghị naanị ndị oji ego achụ ego e nwere n'ala Igbo. E nwekwara ndị ọzọ dịka Leo Stan Ekeh nwere Zinox Kọmputa nakwa Konga.com, dgz. Zitere anyị ndị ọ dị gị ka aha ha e kwesịrị ịdị ebe a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48619885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48619885,Abia Teachers Strike: Ụgwọ gọometị ji anyị karịrị akarị,Ọ bụzịghị ihe akụkọ na ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị nwere n'Abia Steeti gbachiri agbachi kemgbe izuụka abụọ gara aga.,"Ọ bụ maka abụbụọrụ ndị nkuzi na-agba n'ihi ụgwọ ọnwa iri ha sị na gọọmentị ji ha nakwa ihe ndị ọzọ. Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ n'Abia bụ Uchenna Obigwe kwuru na gọọmentị ekwela ndị nkuzi nkwa ịkwụ ụgwọ ọnwa abụọ. Mana nkwa a emeghị ka ndị nkuzi laghachị n'ụlọakwụkwọ dịka ụfọdụ ha ka na-ewe iwe banyere nke a. Onyeisi ndị nkuzi n'Aba-North bụ Njoku C.C gwara BBC Igbo na o nweela ndị nkụzi natarala ụgwọnwa abụọ, ụfọdụ ọnwa atọ. Mana ndị nkuzi gba gburugburu anabataghị ụgwọọnwa atọ gọọmentị chọrọ ịkwụ n'ime ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ. Governorship election: Anyị akwụchala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu Njoku kwuru na ha na gọọmentị zutere mana ndị nkuzi Abia Steeti gbaa gburugburu ekweghi na mpụtara mkparịtaụka ahụ. Kedụ ihe bụ iwe ndị nkuzi a? Njoku C.C sị na ihe ndị nkuzi chọrọ ka gọọmentị Abia Steeti mee tupu ha amalite ọrụ gụnyere; 1. Ịkwụcha ndị nkuzi ụgwọọnwa iri eji ha 2. Ịkwụ ndị nkuzi ụgwọ ezumike ọrụ akpọrọ 'Leave Allowance' 3. Ịkwụ ndị nkuzi ụgwọ mbuli n'ọkwa bụ 'Salary Upgrade' 4. Ịkwụ ndị nkuzi Praịmarị ụgwọ 'Teachers Salary Subsidy'. Otu onye nkuzi Sekọndịrị bụ Anusionwu O. gwara BBC Igbo na akwụghị ụgwọọnwa metụtara ya n'ụzọ dị iche iche. Nke bụ na ego e ji elekọta ezinaụlọ adịghị, na mgbe ụfọdụ, ọ na-abọrọ ndị mmadụ ahịhịa, buoru ndị mmadụ ibu iji hụ ihe a na-eri. Mbọ niile BBC Igbo gbara inweta gọọmentị Abia Steeti site n'aka onye enyemaka mgbasaozi gọvanọ bụ Onyebuchi Ememanka amịtaghị mkpụrụ. Dịka na ọ zaghị ekwentị ya n'oge a kpọrọ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44820307,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44820307,Ụmụ Igbo karịrị asatọ sonyere na ndị ọkaiwu SAN,"Ụmụ afọ Igbo gunyere George Igbokwe, Madu Abuchi, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, sonyere na ndị ọkaiwu e bulitere n'ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ 'Senior Advocates of Nigeria (SAN).'","SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria Ndị ọzọ bụ Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo. Kọmitii ndị ọkaiwu na-ahazi nturuugo nke a kpọrọ 'Legal Practitioners' Privileges Committee (LPPC) ' bulitere ndị ọkaiwu 31 n'ọkwa 'SAN' Onyeisi ọrụ ụlọikpe kachasị ( Chief Registrar of the Supreme Court) bụ Hadizatu Mustapha, bụ onye kwụpụtara nke a ụbọchị Tọọsde. O kwuru si: ""N'ọgbakọ nke agba nke 133 nke e mere n'abalị 12 ọnwa Julaị ebuliela ndị ọkaiwu iri atọ na otu ịbanye n'ime ụlọ. ""Nturugo 'SAN' bụ nzere na-egosi ọkaibe nke a na-enye ndị ọkaiwu ndị gosirila onwe ha dịka ọkaibe na ikpe nakwa agụgmagụ iwu."" Ndị ọzọ soro nweta nturuugo 'SAN' bụ Wole Agunbiade, Essien Udom, ọkammụta Oluyemisi Bamgbose, ọkammụta Waha Egbewole, Olubowale Taiwo, Oluwole Iyamu, Adekole Olawoye, Stephen Adehi na Oluseun Akinbiyi. Ndị ọzọ bụ ọkammụta Isa Chiroma, Metong Urombo, ọkammụta Olanrewaju Fagbohun, Johnson Ojo, Adeyinka Olumide-Fusika, nakwa Olayode Delano na Tanimu Inuwa. Ndị ọzọ bụ Isiaka Mudi, Ikhide Ehighelua, Adewale Atake, Mosediq Kazeem, ọkammụta Muhammed Mustapha-Akanbi na Olabode Olanipekun. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-43297845,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43297845,World Cup: Ọ fọrọ ụbọchị 100 tupu asọmpi ebido,Taa ga-eme ya mbido ọnụọgụgụ ụbọchị 100 tupu asọmpi iko mbaụwa ebido na mba Rọshịa.,"Moscow na-akwado maka iko mbaụwa, lekwa elekere etinyere n'ihu Red Square na Kremlin na-egosi mgbada oge na ụbọchị Ndị mba Rọshịa egosila nkwado ha site n'itinye nnukwu elekere na-egosi ka ụbọchị na oge na-aga n'ihu Red Square na Kremlin dị n'etiti Moscow. A ga-agba asọmpi a site n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị 2018. End of Twitter post, 1 Obi ọ dị gị ụtọ? Ọ kwesịrị ịdị gị maka na ọ bụ nanị ụbọchị 100 fọrọ tupu o bido. Cheta na Naịjirịa, Kroeshia, Ajentina na Aịsland nọ n'ime ofu otu. Naịjirịa na Kroeshia ga-ebu ụzọ sọọ mpi n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun. Ha na Aịsland ga-asọmpi n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun. Ebe ha na Ajentina ga-ezukọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Juun. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43856119,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43856119,Ezeife: Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ,Ndị nwere agba n'ala Igbo ekwuola na ụmụafọ ịgbo ga-ajụ nkwado onyeisiala Buhari na ntulika nke 2019 dịka ha mere n'afọ 2015.,"Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu onye na-ekwuchitere Ndigbo na Niajiria Ha dọrọ Ndigbo aka na ntị ka ha mata na ngwa na ọ bụrụ na ha kwado onyeisiala Buhari ka ọ banye n'ọchịcihị ọzọ n'afọ 2019 na ọkwa onyeisiala ga-erute Igbo aka bụ nkwa a na-ekwe nwaanyị n'elu akwa, nihi na ọ bụ okwu aghụghọ. Na nsọnsọ, otụtụ ndị otu APC gụnyere, Minista na ahụmaka njem bụ Rotimi Amaechi, onye odeakwụkwọ nke gọọmenti etiti bụ Boss Mustafa na kwa onyeisi ndị ụlọọrụ Voice of Nigeria nbụ Ọsita Okechukwu gwara Ndị Igbo ka ha tụnyere Buhari na'afọ 2019, ka oke were rute ha na 2023. Mana ụfọdụ ndị nwere ọnụ n'igbo kwụrụ na okwu ahụ bụ okwụ aghụghọ iji nweta votu Ndigbo, kwụkwọ na ndị dịka Buhari bọrọ ndị Igbo maka entinghirị ya akwụkwọ n'afọ 2015, na ha agahị enyere ya na ntuliaka 2019. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nwere onye chịbụrụ Gọvanọ n'Anambara Steeti bụ Dr Chukwuemeka Ezeife si: ""A hụghị ka ọ ga e si mee. Echeghị na anyị kwesịrị ị na-arịọ ndị mmadụ ọkwa onyeisiala. Uche m bụ na anyị ga-aga rịọ Chineke, Onye mara na ọ bụrụ na onye Igbo were ọkwa dịka onyeisiala, obi ga-adị ndị Fulani mma, dị ndị Yoruba mma, dịkwara ndị mpaghara dị ichiche na Naijiria mma n'ihi na anyị ga-ahazigharị ọnọdụ akụnaụba Naijiria ka ọ ga n'ihu. Ikwu maka 2023 bụ okwu akwụghị ọtọ, onye ọbụla na-ekwu ya bụ iji ghọgbụ Ndịgbo."" N'otu aka ahụ, onye bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Dozie Ikedife, kwuru na Ndigbo bụ ndị ekwerela nkwa inweta ọkwa onyeisiala apụtaghị ihe ọbụịla n'oge gara aga. Ọ gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Sun sị: ""E kwela Ndigbo ọtụtụ nkwa dị otu a n'oge gara aga, aghọgbukwara ndị be anyị. Ọ bụrụ na mmadụ ghọgbụo gị ụgboro abụọ ma ọ bụ atọ, ọ bịa nke anọ, i cheba echiche ime. Ike ala a agwụla mmadụ. Ikedife gara n'ihu kwuo sị : ""Ihe bụ mkpa m bụ otu a ga-esi gbaso iwu na mkparitaụka nweta Biafra na alụghị ọgụ maọbụ kpalia onye ọbụla."" Cheta n'afọ 2015, ọtụtụ Ndigbo atụnyerịghị Buhari akwụkwọ ntuliaka nke mere ka mere o jiri si na ya aghị nye ndị nyere nkwado pasent 95 na ndị nyere ya pasent ise otu ụgwọ, okwu ọtụtụ na-eche o mezuru site ndị o nyere ọkwa ọchịchị kemgbe ọ banyere n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44878668,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44878668,Ụka Anglịkan Aguata: Anyị agaghị agba nwaanyị dị ime akwụkwọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Ụlọụka CMS na diocese Aguata dị na Anambra steeti eburula bata 18 Ha kwuru na ha agaghị anabata nwaanyị dị ime ịgba akwụkwọ maọbụ ndị bikọrọ ọnụ tupu ha alụwa. Naịjirịa Iwe ji ndị Owere na-achọghị ka e wepu osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere. Ndị Owere wuchiri ụzọ na ngaghari iwe iji gosipụta na obo adịghị ha mma gbasara ya bụ ihe chọrọ ime na steeti ahụ. Cheta na a chọrọ iwepụ Madumere nke ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa kwurula na ọ bụghị ihe ziri ezi. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ị makwa aha a kpọrọ ụgbọelu ọhụrụ gọọmenti etiti na-amalite? Gọọmenti etiti kpọrọ ya 'Nigeria Air' ma kwuo na ọ bụ njịkọ aka gọọmentị na ụlọọrụ ndị anọghị na gọomentị ka ugboelu a siri pụta. Akụkọ mba ofesi Ọgụegwu mba Briten bụ Cliff Richard emeriela BBC n'ikpe gbasara mwakpo ya bidoro n'afọ 2014. Cliff Richard ekwughi ọtụtụ okwu oge e kpesiri ikpe ahụ Ụlọikpe kpebiri ka BBC kwuo Cliff ego ruru nde naịra iri itoolu maka mmejọ e mejọrọ ya site n'akụkọ BBC dere na 2014 oge ndị uweojii na mba UK na-enyocha ya gbasara ebubo na ọ metọrọ nwa nwoke. N'egwuregwu, Roma ekwetela iresi otu Liverpool onye oche bọọlụ ha bụ Allison n'ọnụ ego ruru nde paụnds iri isii na isii. A na-atụ anya na Liverpool na Allison ga-enwe mkparịta maka ego ole a ga-akwụ ya nakwa ihe ndị ọzọ. Cheta na a wara ya isi nke gbata gbata maka ọbara na-agba ya n'ụbụrụ n'ụbọchị Satọde. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu" afirika-55227703,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55227703,Anyi ka ga-eme nnyocha n'agbanyeghi na Pius na Ifeyinwa Angbo ekpeziela - Channels TV,"Ọ bụ n'ụbọchị Disemba 3, 2020 ka ihe onyonyo pụatara ebe nwaanyị akpọrọ Ifeyinwa Angbo na-ebo di ya ebubo na o tiri ya ihe.","Pius na Ifeyinwa Angbo Di ya bụ Pius Angbo bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Channels TV. Nke a mere ka Channels TV edepụta okwu nkatọ maka mmadụ iti nwunye ya ihe. N'agbanyeghị mkpebui udo, Kingsley Uranta, ụnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Channels TV sị na ha ka na-enyocha ihe mere. Nke a mere ka ndị mmadụ akatọọ agwa nwoke ahụ ọ kachasị na nwunye ka mụchara nwa n'izuụka anọ gara aga. N'ụbọchị Monde Disemba 4, Gọvanọ na-achị Benue steeti Samuel Ortom kpeziri udo n'etiti nwaanyị ahụ na di ya. Ihe ndị mmadụ kwuru maka mkpezi a Otu onye kwuru bụ Adelere na ihe ọbụla mee nwaanyị ahụ n'aka di ya, ọ bụ n'isi Gọvanọ ahụ Eretha kwuru na mgbu ka na-egosi n'ihu nwaanyị ahụ Gịnị ka ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwuru maka okwu a? Ndị mmadụ na-ajụ ma ụlọntaakụkọ Channels TV a ga-agbachi nkịtị ka nwoke ahụ ka nwere ọrụ ya. Ha na-ekwusiike na o kwesiri ị nọ n'ụlọ mkpọrọ dịka iwu ala Naịjirịa si debe. Onye na-ekwuchitere ụlọntaakụkọ Channels TV bụ Kingsley Uranta gwara BBC na ha kwụsịke n'okwu ahụ ha kwuru gbasara nnyocha. N'olu ya, 'O nwebeghi ihe gbanwere n'okwu anyị kwuru n'agbanyeghị na ya (Pius Angbo) na nwunye ekpeziela'. Cheta na mgbe akụkọ ahụ pụtara n'ụbọchị ụka, ha kwuru na ha ga-enyocha ya bụ ihe ma taa nwoke ahụ ahụhụ maọbụrụ na ikpe mara ya." afirika-43557827,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43557827,Gọvanọ Obiano emeela onye Igala kọmishọna n'Anambara,"Bonaventure Enemali bụ onye Igala, ga-anọchite anya ndị Anambra West n'ọkwa kọmishọna.","Bonaventure Enemali bụ onye abụọ pekarịchara mpe n'afọ ga-abụ kọmishọna n'Anambara steeti Enemali so na kọmishọna 19 Gọvanọ Obiano duru iyi ọrụ n'Awka ụnyaahụ. Obiano mere ya kọmishọna ga-ahụ maka ọganiihu ndị ntoorobịa nke bekee kpọrọ youth empowerment and creative economy. Ọkwa ọhụrụ ya mere ka Enemali dị afọ 33 bụrụ onye abụọ pekarịchara mpe n'afọ ga-abụ kọmishọna n'Anambra steeti, ebe onye nke ọzọ bụ Mark Okoye bụ kọmishọna nke Budget and Economic Planning dị afọ 31. Cheta na enwere ndị Igala na Kogi steeti, Anambara steeti nakwa Enugwu steeti. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe ị na-amaghị gbasara Enemali Ka BBC Igbo na Enemali kwuru n'ekwentị, o kwuru na ọ dị ya mkpa ịhụ na Anambara ga-adị ezigbo mma nke ga-eme ka e bido ịhụ ya dịka dike pụrụiche n'ihe gbasara nrụpụta ihe na azụmahịa. N'okwu ọnụ ya ọ sị ""tupu afọ anọ agafee, Anambara ga-abụ kakaraka n'ihe gbasara akụnaụba, nke ga-eme ka steeti ndị ọzọ nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ jere anyị""." afirika-47451983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47451983,Anambra state: Onweghi ihe m wepụrụ n'Amachalla - Anayo Nnebe,Akụkọ pụtara na-ewu ewu kwuru na Anayo Nnebe wepụrụ igwe mmiri nke ọ gbapere n'Amachalla dị n'Anambara steeti maka na o merighi na ntuliaka.,"Content is not available End of Facebook post, 1 Nnebe bụ onye ji aha APGA zọọ ọkwa nnọchianya Ọka Nọt na Saụt n'ụlọomeiwu nta, dara ntuliaka e mere n'ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị 2019. Onye ọrụ BBC Igbo gara ebe ahụ hụrụ ndị ọrụ na ya bụ ọdọmmiri, kwuru hoha na akụkọ a na-akọ abụghị eziokwu chacha. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Anayo Nnebe n'ekwentị, o kwukwara na ọ bụghị eziokwu. Akụkụ igwe mmiri mebiri emebi nke a rụziri O kwuru na ọ gbapuru ọdọmmiri n'ebe ruru iri abụọ na abụọ n'Ọka niile, na nke Amachalla adịghị iche. Nnebe kwukwara na o nwere ihe mebiri n'ime igwemmiri ahụ tupu e mee ntuliaka, na ọ bụ ya butere akụkọ ụgha nke a. Nwaoji bụ nwoke na-elekọta ya bụ igwemmiri ""Ugbua, igwemmiri ahụ ebidola ịrụ ọrụ dịka e doziri ya ụnyaahụ"" ka o kwuru. Nchọpụta BBC mere nakwa ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị obodo ahụ gosiri na ya bụ akụkọ a na-akọ bụ okpokpo asị kpụ ọkụ n'ọnụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-44135408,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135408,Osibanjo: Gọọmenti ga-etinye N10bn na idozi steeti ọchiehi mebiri,Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo kwupụtara na gọọmenti etiti etinyela aka na akwụkwọ maka mmapụta ijeri naira 10.,"Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu O kwuru na a ga-eji ego a ịrụgharị ma wugharịa obodo ndị nsogbu Fulani na-achiehi na ndịọrụ ugbo metutụtara na Benue steeti na a steeti ndị ọzọ. Osibanjo kwuru nke a n'ụbọchị Tuusde oge ọ gara nleta na ebe ndị gbara ọsọ mndụ nọ na Abagana na daudu dị na okpuru ọchịchị Makurdi na Guma dị na Benue Steeti. O kwuru na ọnọdụ ndị gbara ọsọ ndụ n'ihi ọgbara ahụ na-echu onyeisiala Muhammadụ Buhari ụra. ""O nwere ihe ndị a chọpụtarala; nke mbụ bụ nchekwa. Anyị chọrọ ịgba mbọ ịhụ na ebe ndị e mebiri na e chekwara ya. ""Nke abụọ bụ bụ ịgba mbọ hụ na ndị gbara ọsọ ndụ laghachiri na be ha, alụgharịala . ""Nke atọ na ndị ọrụugbo laghachiri na ugbo ha nakwa na enyere ma ndị abụghị ndị ọrụ ugbo aka ibido ndụ ọzọ."" Ọ gara n'ihu kwa ha na a mapụtala ego a ga-eji belata ahụhụ ha na-ata sị, ""A bịara m ịgwa ụnụ na gọọmenti ala Naijiria nwere ike ichekwa ụnụ ma gbooo mkpa ụnụ, na anyị na ezipụkwu ndị ọrụ nchekwa ka ha chekwaa ụnụ."" N'okwu ya ya, Gọvanọ Benure bụ Samuel Ortom rịọrọ ka gọọment tinyekwuo uchu na nchekwa mpaghara ahụ "" Ọ masị ndị ogbuọbara a si Libya, Boko Haram maọbụ ndị na-achị ehi, sị tinyekwuo nchekwa iji kpochapụ ha na steeti a ka ndị mmadụ nwee ike ịlaghachi na be ha."" Odeeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka gbatagbata na steeti ahụ nke a kpọrọ State Emergency Management Agency (SEMA), bụ Emmanuel Shior, kọwara na ebe ndị gbara ọsọndụ nọ n'Abagana nwere mmadụ ipuku iri atọ na ano, narị itoolu ,iri atọ na isii(34,936) si Benue na Nasarawa steeeti gbaa ọsọ ndụ oge e mepere ya na ọnwa Februwarị mana ugbua e nwere mmadụ puku iri na abụọ, iri anọ na otu (12,041) ebe ahụ. O kwukwara na achịkọta ọnụọgụgụ ndị nọ na ebe mgbata ọsọ ndụ asatọ dị na steeti ahụ, bụ mmadụ otu narị, iri asaa na ise, iri na asaa (175,017.) Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44743603,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44743603,Ifeanyi Ugwuanyi emeriela n'ụlọikpe,Ozi n'eru BBC ntị na ehihie a kwuru na Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugwu Steeti emeriela Sịnetọ Ayogu Eze nke zọbụrụ ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ n'ụlọikpe kachasị.,"Ifeanyi Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu steeti Onye ode akwụkwọ ụkwụ nke steeti ahụ Festus Uzor gwara BBC nke a mgbe anyị kpọrọ ya n'ekwenti tata. Ka ọ dị ugbua ndị ọnụ n'eru na-okwu n'ala Igbo bidolari ikele Gọvanọ Ugwuanyi. Osote onyeisi nke ụlọomeiwu ukwu dị n'Abụja bụ Ike Ekweremadụ kwuru na ya bụ mmeri abụghị nke Ugwuanyi sọsọ mana ọ bụ "" mmeri udo, ike oke nhatanha na mmepe obodo nke Engugwu steeti"". Ekweremadu kwuru na ""mmeri a ga-agba Gọvanọ Ugwuanyi ume ma mee ka omee karịa ka ọ meburu na mbụ"" ma nyekwa ya ike maka ịzọgharị ọchịchị nke afọ 2019. Cheta na Gọvanọ Ugwuanyi na Ayaogu Eze na agbarita mgba n'ụlọike kemgbe ha mechere ndọrọndọrọ nke imeụnọ PDP n' Enugwu nke họpụtara Ugwuanyi. Ayogu gbara akwọkwụ n'ụlọikpe n'arịọ ka ụlọikpe nyere ya aka kagbuo nhọpụta PDP họpụtara Ugwuanyi maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Steeti ahụ maka na usoro esiri họpụta ya ezighị ezi. Mana ụlọikpe mbu ma nke abụọ wezụgara ya bụ arịrọ Ayogu rịọrọ maka na ha sị na ọkpa esịghị ya bụ arịrịọ ike n'ala. Ụgbụa ụlọikpe ụkwu akwadola mkpebi nke mbụ na nke abụọ nke wetere ya bụ isi okwu na njedebe. Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ : Kpochapụ ndị nchekwa juru n'ụzọ ọwụwanyanụ Naịjirịa - Sineti" egwuregwu-49313397,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49313397,Man United vs Chelsea: Ikuku ekuola a hụ otele Chelsea,Eke niile bụ eke mana e nwere eke nwe ọhịa.,"Otu egwuregwu bọolụ Manchester United mere ka ndị Chelsea mata nke a oge ha jị ọkpụ goolu anọ chara acha nyụọ ha ịkpakwụ. Nke a bụ nzute mbụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard na-ezute onwe ha dịka ndị nkụzi bọọlụ. Nke a bụkwa asọmpị mbụ nke Lampard na-agba dịka onye nkụzi na 'English Premier League'. Mana Solksjaer sịrị ya nnọo n'ụzọ pụrụ iche. End of Twitter post, 1 Agbanyeghi na Romelu Lukaku bụ onye onyee goolu ndị Man Utd apụọla, nsogbu ọbụla adịghịrị ha n'eguregwu nke taa. Marcus Rashford nyere goolu nke mbụ site na penariti, mgbe Zuma gbaturu ya. Anthony Martial mezuru ya abụọ n'agba nke abụọ, ebe Rashford nyekwara goolu ọzọ. Daniel James Daniel James, bụ onye Man Utd zụtara ọhụrụ, nyere goolu mbụ ya iji gosi na ọbịaghị ilegharị anya. Harry Maguire na Aaron Wan Bissaka gosikwara ihe kpatara Man Utd ji zụọ ha oke ọnụ ahịa. Ndị Chelsea nwekwara obere chi ọjọọ mgba Tammy Abraham nakwa Emmerson gbara ọtụnigwe n'agba nke mbụ. Ụfọdụ ndị Chelsea ji eme ọnụ esokwaghị n'egwu nke taa n'ihi mmerụ ahụ. Ndị a gunyere Antonio Rudiger, Willian, Reuben Loftus-Cheek, nakwa Callum Hudson-Odoi. Ngolo Kante, onye etiti ndị Chelsea, batara na nkeji iri asaa na anọ. Etu ihe si kwụrụ ugbua, Man Utd bụzị ndị nke abụọ na EPL ebe ndị mbụ bụ Manchester City. Liverpool bụ ndị nke atọ ebe Brighton bụ ndị nke anọ. Mana nke a adịchaghị mkpa ugbua n'ihi na chi ka na-efo efo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48144880,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48144880,"May 29, 2019 in Nigeria: Taa ka ọchịchị ga-esi aka fere aka",Taa bụ abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee ka ọchịchị ga-esi n'aka fere aka dịka Naijiria na-abanye agba ọhụrụ n'ọchịchị onyekwuocheya.,"Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aṅụ iyi ọkwa oche onyeisiala Naịjirịa Taa ka onyeisiala Muhammadu Buhari na-abanye agba nke abụọ dịka onyeisiala dịka o merichara na ntuliaka 2019. Buhari banyeburu agba nke mbu ya na Mee 29, afọ 2019. Ndị gọvanọ steeti na-aloghachi gụnyere; Dave Umahi (Ebonyi), Ifeanyị Ugwuanyi (Enugwu), Okezie Ikpeazu (Abia), Ifeanyị Okowa (Delta), Nyemso Wike (Rivers) na Emmanuel Udom (Akwa Ibom). Umahi,Ugwuanyi,Ikpeazu so na ndị gọvanọ na-alọghachi agba nke abụọ ha Ndị ọzọ bụ: Samuel Ortom na Benue Simon Lalong - Plateau Atiku Bagudu - Kebbi Nasir El-Rufai bụ gọvanọ ọhụrụ nke Kaduna Ben Ayade - Cross River Darius Ishaku - Taraba Aminu Masari - Katsina Mohammed Badaru nke Jigawa ga-abanyekwa agba nke abụọ ha dịka gọvanọ steeti ha dị iche iche. E nwekwara ndị ga-abanye oche ọchịchị mbụ ha dịka gọvanọ ọhụrụ taa. Emeka Ihedioha so na ndị ndị ga-abanye oche ọchịchị mbụ ha dịka gọvanọ ọhụrụ taa Ha gụnyere mmadụ dịka: Emeka Ihedioha nke PDP (Imo) Babajide Sanwo-Olu nke APC (Legọs) Muhammad Inuwa Yahaya nke APC (Gombe) Seyi Makinde nke PDP (Oyo) Dapo Abiodun nke APC (Ogun) Abdulrahman Abdulrazaq nke APC (Kwara) Babagana Zulum nke APC (Borno) Abdullahi Sule nke APC (Nasarawa) nakwa Muktar Idris nke APC (Zamfara). Anambara steeti, ebe Willie Obiano nwetara meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017,so na steeti enweghị ntuliaka gọvanọ n'afọ 2019 Mana a gaghị enwe ndị ga-abanye ọkwa gọvanọ n'Anambra, Edo, Ekiti, Bayelsa, na Ondo na Osun dịka ha merela ntuliaka ha tupu ugbua n'ihi nsogbu gbaso ntuliaka e meburu na steeti ndịa n'oge gara aga. Taa, dịka Mịnịsta Mgbasaozi bụ Lai Mohammed siri gbaa n'ama, a ga-eme emume mnyefe ọchịchị na nwayọọ, na-emeghị mkpatụ ọbụla. Dịka o siri kọwaa, nke a bụ n'ihi na gọọmenti ebupụla emume ncheta ọchịchị onyekwuoucheya gaa ụbọchị Juun 12, n'iji kwanyere MKO Abiola bụ onye nwụrụ dịka ọ na-alụ ọgụ maka mmeri o meriri na ntuliaka Juun 12, afọ 1993. Cheta na n'afọ 2000, ọchịchị Olusegun Obasanjo mapụtaburu ụbọchị May 29 dịka ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya iji cheta ndị uwe kakị iwere ọchịchị nyefee n'aka ndị nkịtị mana n'afọ 2018, ọchịchị Buhari higharịrị ya bụ emume buga ya n'abalị Juune 12 kwa afọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44014337,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44014337,'Aka m adịghị na ọgbaaghara dara na Rivers' - Amaechi,Minista na-ahụ maka ibugharị mmadụ site otu ebe ruo ebe ọzọ n'ime Naịjirịa bụ Rotimi Amaechi ekwuola na ọbụghị maka ya ka ọgbaaghara dara na Rivers steeti ugbua.,"Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Otu ndọrọndọrọ APC ga-eme ọgbakọ ha taa mana ọtụtụ mmadụ na-eme nghagharị iwe batara n'ụlọ ọrụ APC ụnyahụ n'iwe, ha kwuru na obi adịghị ha mma gbasara ọtụtụ ihe na-eme na APC. Ha kwukwara na ndị na-akwado Amaechi n'ime APC na-achọ ị kwusị ndị na-akwado omeiwu Magnus Abe ị bata n'ọgbakọ a. Ha na-ebo kwa Amaechi na ndị na-akwado ya ji azụ aka na-ere akwụkwọ eji edenye aha maka ọgbakọ a. APC bụ otu ndọrọndọrọ na-achị Naịjirịa ugbua Mana Amaechi kwuru na onweghị onye obụla na-ere akwụkwọ a. N'ime ọnụ ya: ""biko gaa ụlọakụ jee zụọ akwụkwọ nbinye aka gị, sọọsọ ebe ahụ ka ha na-ere akwụkwọ a"". Ka ọ dịgodị, gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike ka na-achị ọchị na ihe a na-eme na APC gosiri na otu ndọrọndọrọ ọchịchị a nwere nnukwu nsogbu gbasara nkewa dị n'etiti ha. N'otu akụkọ a, mana n'aka nke ọzọ, onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari nọ na Daura, onye enyemaka ya puruiche n'ọrụ gbasara mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuru na o ga-esi Daura gaa Rivers maka ọgbakọ APC na steeti ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44743607,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44743607,Otu nwoke agbaala onwe ya ọkụ na ndụ na Legọs,Nwaokorobịa a na-eche na ọ gbara afọ iri abụọ (20) mụnyere onwe ya ọkụ na Omole Phase 1 Legọs.,"Ọtanisi mere ka ọtụtụ mmadụ na-egbu onwe ha na Niajịrịa Nwaamadị a amabeghị aha ya bu mmanụ ụgbọala na mkpaọkụ kọrọ ka ihe isiike sị anyụ mmmadụ ịkpakwụ na Naịjirịa. Ben Chinedu bụ onye huru nwaamadị a korọ ndị nta akụkọ ka o sị eti mmkpụ ka ọha nụrụ onu ya tupu obie onwe ya ajọ aka ahụ. Ọ sị na ""ndị mmadụ gbakọrọ na geti ebe ahụ mgbe nwaamadị a hapụrụ onu ya aka na-arịọ ka ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyem aka mana onye ọ bụla nyuru ntị mmaụ ma na-akọrọ ya ka ụwa nke ha sị ka njọ"". Ọ kọrọ ndị mmadụ na ""obodo a agaghị adị mma ọzọ"". Ọ sị na nwoke ahụ gwara ha na obodo Naịjirịa enweghị mmekwata nke o ji ebụ ụmụnororbịa n'ụche. Ọ kọrọ ka ike ụwa siri gwu ya maka ọchịeze ndị mmadụ jị ebi na obodo a. Mgbe ọkwuchara nke a, ọkpara ọkụ mụnye onwe ya na ahụ. Chinedu sị na ha chọwara mmiri iji gbanyụ ya bụ ọkụ. Mana tupu ha bia na ""ya bụ ọkụ agbaala nwoke ahụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma"". Ha kpọrọ ndị ụweojii ka ha bịa bụrụ ya bụ nwoke. Mgbe ha jiri bịa, nwaamadị ahụ na uche ya esoghịzị. ""Anyi amaghị onye ọbụ maọbụ ebe osi"", dịka Chinedụ kwara ndị nta akụkọ Sun." afirika-46073114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46073114,"Gịnị kpatara nwaanyị ji gbuo onwe ya, di na ụmụ ya atọ ?",Ndị uweojii nọ na Benue steeti agwaala BBC Igbo na etu ha sị hụ ozu ezinụlọ gụnyere nne na nna nakwa ụmụ ha atọ n'ime ụlọ ha.,"Homicide: Anyị ka na-enyocha ihe gburu ezinaụlọ a-Uweojii Joel Moses bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na ndị agbata obi ezinaụlọ a bịara ị kpesara maka ihe mberede a merenụ n'abali ụnyaahụ. O kwuru na mgbe ya na ndị otu ya wuchiri na be ezinaụlọ a, ha hụrụ ka ozu ha niile tọgbọrọ n'ọbara ma hụ mma dị n'aka nke nne ezinaụlọ ahụ nke pụtara na o nwereike bụrụ na o magburu onwe ya. Moses kwuru na ndị agbata obi ezinụlọ a kwuru na ha hụrụ nne ezinụlọ ahụ ebe o ji aka ọdụ esukasi ụgbọala di ya tupu di ya alọta na mgbede ụbọchị ihe a mere. O kwukwara na ndị agbata obi gwara ya na di na nwunye a na-alụ ọgụ oge niile. Moses kwuru na ruo ugbua amabeghị ma ọ bụ nke nwaanyị gburu onwe ya ma gbuo di ya na ụmụ ya. Mana agbata obi gwara ndị ntaakụkọ na ọghaghị ị bụ nne ezinụlọ a sugburu ndị be ya. Akụkọ na-ekwu na ""internet"" bụ na di na nwunye a na-arụ na ụlọọrụ okpuru ọchịchị Makurdi akwụkwọ akụkọ ""The nation"" siri depụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46667796,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667796,Bethlehem: Lee ka ndị si ebe a mụrụ Jesu si agba Ekeresimesi ha,Akụkọ na-eru anyị nti na-ekwu na ndị Bethlehem ebe a mụrụ Jesu na-agba Ekeresimesi n'ụzọ pụrụ iche.,"Ụlọ ezumike dị iche iche juru kpum kpum makana ndị njem nsọ jupụtara n'ime ya. Nchekwa zuru oke dịkwa. Ha gbakọtara n'abali fopụtara ụbọchị Ekeresimesi kwụrụ n'ahịrị ịhụ ebe e kwuru a mụrụ Jesu Kristi. A kakwara ụka ime abali ebe Pope Francis dowere ụka na Vatican iji wee ṅụ ọṅụ ọmụmụ Jesu. N'agbanyeghị mwakpo ndị Palestinian n'oge gara na Bethlehem, akụkọ kwuru na ihe niile na-aga nke ọma. Ọtụtụ emume na-enye obi anụrị na-agakwa n'ihu n'ụka a kpọrọ ""Church of Nativity"" Bethlehem. Obodo Israel were ogige gbochie mwakpo ndị Palestine kemgbe afọ 2015. Ndị Palestinian na-ahụta nke a dịka ị nara ha ala ha makana ha na-ekwu na ogige ahụ metụtara oke ala ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46382057,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46382057,#Fight4Naija: Kedụ onye bụ osote Oby Ezekwesili?,Ụfọdụ ụmụ Naịjiria kwuru na etu Oby Ezekwesili si họpụta onye ugwu dịka osote maịrị ha.,"Ezekwesili kwuru na ọ ga-akpọpụta ụmụ Naịjịrịa ruru nde iri asatọ n'ụbịam End of Twitter post, 1 N'otu aka ahụ, ụfọdụ kwuru na Ezekwesili na-arọ nrọ ma kwuo na Ganiyu Galadima abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama. Cheta na Ezekwesili depụtara n'akara Twitter ya na Galadima dịka osote ya ga-enyere ya aka ịmata ndị a nachị nọ n'igbe ụlọ, ọfụma. O kwuru na Galadima ghọtara ebumnobi ya gbasara ịchị Naịjirịa ma kweta na ọ ga-enyere ya aka nke ukwu n'iweta ya na mmezu. Onye bụ Ganiyu Galadima? Ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ekwu maka nhọpụata a n'elu soshal midia: Armstrong Armstrong kwuru na ihe Ezekwesili mere gosiri amamihe. Keezy Boiwonda, na-ajụ ihe mere Ezekwesiri ji họrọ onye ""Hausa"" karịa ịhọrọ onye Fulani. Ihe Keezy Boiwonda kwuru Mana Onyia Fabian Nnamdi, gwara Ezekwesili ya gaa zuo ike makana ọchịchị Naịjirịa abụghị nke ndị Igbo. Ihe Onyia kwuru Azi Somtochukwu na-ajụ ma enweghị onye chọrọ ịhọrọ onye Yoroba dịka osote ya n'ọsọ ntuliaka nke ugbua? Ihe Somtochukwu kwuru Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-53430359,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53430359,Funke Oshonaike: E tiri m ihe ma wakpoo m n'ike,ỊDỌ AKA NA NTỊ: WARNING: Akụkọ a nwere ebe ndị nwere ike irikasị gị ahụ .,"Funke Oshonaike dị afọ 45 malitere ịpịa tennis mgbe ọ dị afọ 14 ""Oge niile m nụrụ akụkọ gbasara mwakpo, ọ na-akpọghachị n'ihe meburu m. Etiri m ihe ma wakpoo m n'ike. Ọ bụ ihe mere m."" Naịjiria na-etinye anya n'ihe gbasara ịwakpo nwaanyị n'ike nakwa etu e si akpaso nwaanyị agwa. Otu onye n'ime ndị na-ekwuputa ihe ha gabigara bụ Funke Oshonaike nweterela ihe nrite Olimpiks ugboro isii. Oshonaike nwetakwarala ihe nrite ugboro atọ n'Afrịka, kwuru na ọ bụ Uwa Omozua, nwa dị afọ 22 a wakporo n'ike tupu e gbuo ya n'ụlọụka dị na Benin City Edo steeti, kpalitere mmụọ ya ikwuputa ihe ọ gabigara. A hụrụ ozu Omozua ka a gbara ya ọtọ, n'ụlọụka ahụ - nke butere ọtụtụ ngagharịiwe na Naịjirịa, ebe ndị mmadụ na-ekwu na ha chọrọ ikpe ziri ezi. Oshonaike kwuru na ihe mere Omozua kpalitere ihe ya na onwe ya gabigara mgbe a wakporo ya. ""Ọ bụbu enyi m - anya asabeghi m mgbe ahụ. ""Mgbe iwe were ya, o tiri m ihe. O were mkpịsị aka ya abụọ pido anya m, o wee dina m n'ike. ""Ike gwụrụ m, ọbara juchaa m n'ahụ. ""Amaghị m na a na-akpọ ya iwakpo n'ike. Naanị ihe m ma bụ na ọ bịara dị m ka atịtị juru m n'ahụ."" Oshonaike chọrọ ịbụ onye ụmụnwaanyị e metọrọ ga na-elere anya 'O ji ji jide mma' Oshonaike malitere ịpịa tenis oge ọ dị afọ 14, ka naanị afọ abụọ ọzọ gachara, o sonye otu Naịjirịa so gaa asọmpi All Africa Games nke afọ 1991. Mana Olimpiks mbụ ọ gara bụ nke afọ 1996 - mgbe ahụ a malitela iwakpo ya n'ike. ""Anọ m na mahadum Legọs mgbe ahụ - M ga-ebu apa n'ahụ m niile wee gaa ụlọakwụkwọ, ndị mmadụ a na-ajụ ihe mere m. ""Mana enweghi m ike ịgwa mmadụ. Ọ dịka e mere m ọgwụ. Abụ m odibo n'aka ya."" Mwakpo a mere oge Oshonaike na-esokwa aga asọmpi ma na-emerikwa na Naịjirịa. Mana n'agbanyeghi na anya ndị mmadụ nọ ebe ọ nọ, ọ hụrụ onwe ya n'ezigbo mkpagbu. Ebe o si ka njọ bụ na nwoke na-awakpo ya bịara na-ejide akụ ọ na-akpata. Oge ọbụla ọ chọrọ ịpụ ma jụkwaa ese ego ya, e tie ya ezigbo ihe, merụọ ya ahụ. O kwuru sị ""Ọ sị m nye ya ego niile m kpatara. ""Oge ọbụla m chọrọ igbafu, m jụọ ya ese ego - mana ọ ga-ajụ iwepụta ya. ""Abụrụla m ọkaibe na Naịjirịa mgbe ahụ, mana obi akaghị m ịgwa onye ọbụla ihe na-eme. M ga-aga n'otu ebe gaa bee akwa. Ụfọdụ oge ọ dị m ka m gbuo onwe m."" Ịzọpụta isi ya Oshonaike kwuru na obi mechara kaa ya ịzọ isi onwe ya, ọ mara na ọ baghị uru ịwụsa ọwa. Ọ chọrọ itinye uchu n'ịhụ na nrọ ọ na-arọ ịbụ ọkaibe na tenis mezuru. ""Nwoke a werechara ihe niile m kpatara, mana m gbara isi akwara hụ na m mechara kwụrụ n'ụkwụ m. ""Chukwu nọ na-edu m. Akụkọ Oprah Winfrey na Joyce Meyer so gbaa m ume hụ na gara n'ihu. ""Ebidokwara m ụwa n'isi ọzọ.” Funke Oshonaike nọchitere anya Naịjirịa ugboro isii n'asọmpi Olimpiks Oshonaike bụ onye bu ma fee ọkọlọtọ ndị nọchitere anya Naịjiria n'asọmpi Olimpiks ikpeazụ e mere, nke Rio 2016, diri ihe ndị ọ gabigara kemgbe ọ hapụrụ onye na-awakpo ya. “Ihe m gabigara ahapụghị m ozugbo, ọ metụtara ma aramara nakwa alụmdi na nwunye m."" ""Aka m na-enweta onwe m ugbua.” Oshonaike dị afọ 45 tara asaghị anya nakwa soshal midia ụta maka ụmụnwaanyị enweghi ohere ikwuputa ihe ha gabigara. “Oge nke m anyị enweghi soshal midia, obi akaghị ụmụnwaanyị ikwuputa ihe ha na-agabiga. ""Aghọtaghị m ihe ọ na-eme m oge ahụ. Naanị nsonso a ka m ghọtara na ọ bụ mwakpo ka ọ na-awakpo m."" Oshonaike kwuru na ọ bụrụla onye ụmụnwaanyị e metọrọ na-elere anya. Ọ na-agba mbọ ịhụ na ụmụnwaanyị nwetere ikike ha ma kwụrụ n'ụkwụ ha ma ha gabigachaa ụdịrị ihe a. ""Ihe niile m gabigarala emeela m onye a na-elere anya. M na-akọnwuru ụmụnwaanyị ụdịrị ihe a mere akụkọ m dịka m na-agbakwa ha ume ka ha agbaghapụla onwe ha. ""Enwere m olileanya na ụmụnwaanyị ọzọ ka ga na-apụta na-ekwuputa ihe ha gabigara. ""Isi m pụtara.""" 43440309,https://www.bbc.com/igbo/43440309,"N'Oklahoma, otu nwaanyị ga-aga mkpọrọ maka ịlụ nwa ya","Patricia Ann Spann, onye gbara afọ iri anọ na ise kwetara na ya na nwa ya nwaanyị bụ Misty Velvet Dawn Spann dị afọ iri abuo na isii, gbara akwụkwọ ma nwe mmekọrịta ndị bụ ọbara ya.","Nwaanyị a lụbụrụ nwa ya nwoke A nara nwaanyị a ụmụ ya ma ha bịakọrịtara ọnụ ọzọ n'afọ 2014. Ha lụrụ onwe ha oge anabatara n'iwu nwaanyị ịlụ nwanyị maọbụ nwoke ịlụ nwoke ibe ya na mpaghara ahụ. Ndị nyocha chọpụtara na Patricia Ann Spann lụburu nwa ya nwoke mgbe nke ahụ dị afọ iri na asatọ, ebe nwata nwoke agbụ bibiri njikọ ahụ n'afọ 2010. Akụkọ ga-amasị gị: Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka nleta chọpụtara maka nwaanyị ahụ na nwa ya oge ha jere nleta n'ụlọ ha. Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, Misty Spann bibiri njikọ ya na nne ya n'ọnwa Ọctoba afọ gara aga ka nwechara ndọrịta ụka na nne ya jịrị aghụghọ duba ya na njikọ ahụ. Misty Spann kwuru na nne ya tụrụ ya asị na ya na ""ọkaiwu atọ kpara ndị nyere ya ndụmọdụ ya ga n'ihu na nsọgbụ adịghị na njịkọ ahụ"". Patricia Ann Spann kwuru na ya kwenyere na njikọ ha emegideghị iwu n'ihi na edebaghị aha ya n'akwụkwọ ọmụmụ nwa ya nwaanyị dịka nne mụrụ ya ebe ha zutere onwe ha afọ abụọ tupu ha ejikọ aka. Misty Spann kwetara na ya mebiri iwu megidere mmekọrịta ndị bụ ọbara. E nyere ya afọ iri maka nyocha na nleta na aka ọchamara ihe gbasara akọ na uche. Ebe nne ya bụ Patricia ga-atukwasị nyocha afọ asatọ n'elu mkpọrọ a tụrụ ya. A ga tinyekwa aha ya n'akwụkwụ dịka onye metọrọ mmadụ ma ọ pụta na nga. N' iwu dị na mpaghara Oklahoma, mmadụ ịlụ ọbara ya bụ mmetọ ọbara ma ha enwere maọbụ na ha enweghị mmekọrịta ahụ ọbụla." afirika-49445475,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49445475,Dino Melaye ekwuola na ọ ga-azọta oche gọvanọ Kogi state,Dino Melaye ekwuola sị ụjọ atụla onye ọbụla maka nchutu n'ọkwa sinetọ ụlọikpe chuturu ya.,"End of Twitter post, 1 O kwuru sị na nke chere ya n'ihu ka mma, makana o nwere olileanya ịzọta oche gọvanọ Kogi steeti mgbe a ga-eme ntuliaka ọhụrụ. Ike Ekweremadu agaruola Enugwu Ndị Enugwu west bụ ndị ọ na-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu ukwu nabatara Ike Ekweremadu ka ọ batara Enugwu, ebe ọ nọ kọwaara ha ihe mere ya na mba Jamini. O kwukwara na ọ gbagharala ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) wakporo ya. Ndị na-akwado Ekweremadu dọkwara ndị otu Ipob aka na ntị, sị ha anwakwala anwa metụ Ekweremadu aka ọzọ. Ndị gbakọrọ n'ụlọ Ekweremadu Buhari ga-eme njem Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari ga-aga mba Japan ụbọchị ụka bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa a, ebe ọ ga-esonye nzukọ gbasara mwulite mba Afrịka nke a kpọrọ ""Tokyo International Conference on African Development"". Nzukọ a bụ nke ugboro asaa a na-eme ya, ga-agwụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa a. N'ofesi, Ala eriela David Koch bụ onye nke iri na otu kacha nwee ego n'ụwa. Koch dị afọ iri asaa na itoolu nwụrụ site n'ọrịa kansa ọ na-arịa kemgbe. N'egwuregwu, Gịnị ka ị ga-asị Fernando Torres gbabuuru otu egwuregwu Chelsea, Liverpool na Atletico Madrid dịka o koliri akpụkpọụkwụ bọolụ ya? Cheta na Torres so mba Spen bulie Iko Mbaụwa n'afọ 2010 ma nwetakwa ihe nrite ndị ọzọ dị iche iche. Dịnụ njikere maka abụbụ ọrụ na-enweghị atụ - NASU na SSANU Ụmụakwụkwọ mahadum Ndị otu ""Non Academic Staff Union of Universities"" nakwa ndị ""Senior Staff Association of Nigerian Universities"" ekwuola na ha ga-agba arụkwaghịm nke onweghi onye ma mgbe ọ ga-akwụsị n'oge na-adịghị anya. Iwe ha bụ na gọọmentị achọghị itinye anya na mkpesa niile ha na-eme, na-agbanyeghi na ha agbabuola abụbụ ọrụ abalị ise iji dọọ gọọmentị aka na ntị. N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ ha nwere ụnyaahụ, osote onyeisi ndị SSANU bụ Solomon Alfa kwuru na gọọmentị etiti na-akpa oke. O kwuru na anaghị eme ndị NASU na SSANU etu e si eme ndị ogbo ha bụ ndị ""Academic Staff Union of Universities"" ASUU. Alfa gara n'ihu kwuo na abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị ha gbaburu ga-ebi tn'ụbọchị Fraịdee abalị iri abụọ na atọ nke Ọgọst. Mana ndịisi NASU na SSANU ga-enwe nzukọ iji kpebie ihe ọzọ ha ga eme. Ndị omekome ga-ahụ ịwa n'Enugwu Suleiman Balarabe, onyeisi ndị uweojii n'Enugwu Gọọmentị Enugwu Steeti nakwa ndị uweojii na steeti ahụ eforola ntutu taa na ha ga-ahụ na anwụchiri onye maọbụ ndị ji mma sugbuo otu nwaanyị dị ime n'ugbo ya n'ụtụtụ Wednesday. Osote gọvanọ Enugwu bụ Cecilia Ezeilo na onyeisi ndị uweojii steeti ahụ bụ Suleiman Balarabe kwere nkwa a oge ndị obodo Nchatancha mere ngagharịiwe ma nọchie okporoụzọ awara si Enugu gawa Abakiliki. Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe Ndị omekome na-akpazi nnọọ ajọ ike na mpaghara dị icheiche n'Enugwu. Cheta na ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi gbagburu ndị ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ n'ọdịnso a. A tọrọkwaara onye eze ọdịnala ndị Agbogugu n'okpuru ọchịchị Awgu. Ọkụ ọgbụgba n'ọhịa Amazon N'ofesi, oke ọkụ ọgbụgba n'ọhịa Amazon nke dị na mba Brazil na-enye ndị ọchịchị n'akụkụ ụwa niile isiọwụwa ugbua. Amazon bụ oke ọhịa kachasị n'ụwa niile nke ndị ọkacha mara kwuru na ọ na-enye aka ibelata ekpomọkụ ụwa nke a akọrọ Global Warming na asụsụ bekee. Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị' Wolves etinyela otu ụkwụ na Europa League N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Wolverhampton Wanderers nke Ingland ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Torino nke Italy n'asọmpi nke mbu maka itozu iso gbaa asọmpị Europa League nke afọ a. Agba nke abụọ ga-adị n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" mba-uba-47888516,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-47888516,Black Hole: Ọ ga-elonwu ụwa?,Ndị na-enyocha mbara igwe ewepụtala foto ebe ha setere 'mpio ojii' dị n'otu ụyọkọ kpakpando (galaxy).,"Nke a bụ foto mpio ojii mbụ mmadụ na-eseta. Ndị ọkammụta sayensị kwuru na ihe e ji atụnyere etu ọ ha bụ na o ji ihe ruru ugboro nde atọ karịa etu ụwa ha, ma jiri ihe ruru ijeri 40 tee aka. E ji ihe e ji enyo mbara igwe nke bekee kpọrọ ""telescope"" asatọ wee sete foto mpio ojii a bekee kpọrọ ""black hole"". Ọkamụta Heino Falcke si na mahadum dị na Mba Neitherlands, ebe esi wepụta atụmaatụ a kwuru na ha hụrụ ya bụ ""black hole"" na ọgbakọ kpakpando akpọrọ M87. ""Ihe anyị hụrụ karịrị ụwa ebe anyanwụ na-eru na mbaụwa niile"", Falcke kwuru. Falcke kwuru na mpio oji a bụ ọkachasị na mpio ojii ahụgoro na mbaụwa niile . Ndị sayensị kọwara ihe ha hụrụ na ya Gịnị ka ha hụrụ na ""black hole""a? Ha chọpụtara ọla ọkụ gbara ya okirikiri bekee kpọọ ""ring of fire"". Ọkụ a na-egbuke egbuke chakarịrị ijeri kpakpando dị n'ime ọgbakọ kpakpando ya mere e ji hụtali ya n'akụkụ ụwa. Ihe ndị mmadụ na-ajụ bụ kedụ ihe ga-eme maọbụrụ na otu ihe daba na mpio oji ahụ. Gịnị bụ ""black hole""?" afirika-44777521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44777521,Etu APGA si gbalahụ isonye na CUPP,"Otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), otu R-APC nakwa ọtụtụ pati ndị ọzọ ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke Bekee kpọrọ 'Memorandum of Understanding' iji bịakọta ọnụ.","Willie Obiano bụ Gọvanọ Anambra steeti bụ onye otu APGA Pati ndị ọzọ so n'ime otu ọhụrụ a bụ SDP, NCP na ụfọdụ ndị ọzọ mana APGA esoghi n'ime ha. Mgbe BBC gbara APGA ajụjụ ọnụ ihe mere ha ejighi sonye otu ọhụrụ a, Victor Ike Oye bụ onyeisi oche pati a kwuru na ọ bụghị iwu na pati niile ga-esonye na nke ọhụrụ ahụ. N'ọnụ ya ""ọ bụ iwu na APGA ga-esonye ihe ọbụla otu ndị ọzọ na-eme?"" Maka ọdịnihụ APGA, o kwuru na ha dị njikere maka ntuliaka ga-eme n'afọ 2019. Oye kwuru na ""ntuliaka bụ agha, onye na-eje agha anaghị egosi atụmatụ na nkwado ya niile tupu alụọ agha"". Victor Umeh, onye meriri ntuliaka Sineti ndị Anambra ebe mpaghara Etiti nke e mere n'ụbọchị 16 Jenụwarị, 2018 Kedu otu ndị sonyere n'otu ọhụrụ ""CUPP""? Ihe ruru otu ndọrọndọrọ ọchichị iri atọ bụ ndị pụtara ikwado nakwa isonye n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ n'Abuja ụnyaahụ. Ndị a gụnyere: Etu njịkọ a ga-esi rụ ọrụ Ajụjụ dị ụfọdụ mmadụ n'ọnụ bụ etu otu ọhụrụ a a ga-esi rụọ ọrụ nakwa họpụta otu mmadụ ga-azọ ọkwa ọchịchị n'aha ha. Otu ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Japhet Omojuwa kọwaara BBC etu njịkọ pati ndị a ga-esi rụọ ọrụ. N'ọnụ ya 'njịkọ ndọrọndọrọ adịghị emeri otu pati ji ọkwa ọchịchị mana o nwereike ime n'afọ'. O kwukwara na ha emeghị njikọ a n'oge. Ọzọ, Omojuwa kwuru na n'ime njiko a, e nwere ụfọdụ ndị na-achọ ịzọ ya bụ ọkwa ọchịchị, ọ sị na nke a nwereike ibute esemokwu n'etiti ha. Ọ dụrụ ha ndụmọdụ ha jiri nwaayọ chee echiche n'ime onwe ha ma ha nwereike imeri ntụliaka nke 2019 tupu ha emee ihe dị na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44839623,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44839623,World Cup 2018: France ebuliela Iko Mbaụwa 2018,Frans ebuliela Iko Mbaụwa nke afọ 2018 ka ha ji 4-2 merie Kroeshia.,"Onyeisi FIFA bụ Gianni Infantino nakwa Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin, Onyeisiala Frans bụ Emmanuel Macron nakwa Onyeisiala Kroeshia bụ Kolinda Grabar-Kitarović, so na ndị na-ekwe ndị gbara bọọlụ n'aka ma na-enye ha ihe nrite ha nwetara n'agbanyeghị na mmiri bidoro izo. Ndị nwetara ihe nrite Kylian Mbappe si Frans nwetara ihe nrite 'young player of the tournament', maka ịbụ onye pere mpe kachasị mee ọfụma n'asọmpi a. End of Twitter post, 1 Thibault Courtois bụ onye Beljiọm, nwetara ihe nrite 'golden glove' maka ịbụ ochee goolu kacha mee ọfụma n'asọmpi a. Luka Modric bụ onye Kroeshia, nwetara ihe nrite 'golden ball' maka ịbụ onye kacha gbaa bọọlụ ọfụma n'asọmpi a. Eden Hazard bụ onye Beljiọm bụ onye nke abụọ kacha gbaa ọfụma ebe Antoine Griezmann bụ onye Frans bụ onye nke atọ. Harry Kane si Ịngland, nwetara ihe nrite 'golden boot' maka ịbụ onye kachasị nye goolu n'asọmpi a. O nyere goolu isii. Ndị Frans na-atuli Deschamps elu maka ịkpọ ha gaa ma merie Iko Mbaụwa a. Nke a bụ Iko Mbaụwa abụọ ha na-ebuli. Cheta na ha buliri ya n'afọ 1998. Didier Deschamp bụ onye nchịkọta ha esonyela na naanị mmadụ atọ buliri Iko Mbaụwa dịka ọgbaa bọọlụ nakwa dịka onye nchịkọta. Nkeji 90+5: Lloris aghọrọla bọọlụ Perisic gbara ka a na-egbuchi bọọlụ. Nkeji 90+3: Pogba enwetala ohere inye goolu ọzọ, mana ọ banyeghị ya n'ụkwụ ọfụma. Nkeji 90+2: Vsraljko enwetala akwụkwọ edo edo. Nkeji 90: E tinyekwuola nkeji ise. Nkeji 89: Kroeshia ebutela bọọlụ, Kramaric bunyere Rakitic gbara shọọtụ ma gbafee ya n'elu neetị. Nkeji 86: Fekir agbaala shọọtụ na poostu Kroeshia mana Subasic ghọrọla ya. Nkeji 82: Pjaca a ka webatara ewebata enwetala ohere inye Frans goolu ka Modric bunyere ya bọọlụ, mana ọ bataghị ya n'ụkwụ ọfụma Nkeji 81: Frans ewepụla Giroud tinye Fekir. Nkeji 81: Kroeshia ewepụla Strinic tinye Pjaca. Nkeji 79: Mmehie ahụ Lloris mere e ji nye ha goolu etinyela ndị otu ya na gbagharịa. Nkeji 77: Modric bulitere bọọlụ bunye Mandzukic, Umtiti eburu ya gbafuo mana ọ batara n'ụkwụ Kramaric bunyere ya Rakitic. Mana Rakitic gbafuru ya akụkụ poostu. Nkeji 75: Vrsaljko nwetara ohere iji gbaa bọọlụ na poostu Frans, mana Umtiti na Varane gbochiri ya. Nkeji 73: Frans ewepụla Matuidi tinye Tolisso. Nkeji 71: Kroeshia ewepụla Rebic tinye Kramaric. Nkeji 69: GOOOLLLUUU!!!! Mandzukic enyela goolu ka Lloris atụtụghị bọọlụ a gbalaara ya azụ. Nkeji 65: GOOOOLLLLUUUU!!!! Mbappe enyela goolu. Frans na-agba 4-1. Frans anaghị enyezi Kroeshia ohere imegharị ahụ. Nkeji 59: GOOOOLLLLUUUU!!! Pogba agbakpuola bọọlụ na neetị. Nkeji 55: Frans ewepụla Kante tinye N'Zonzi Nkeji 52: Ndị nkwado amabatala n'ọgbọ egwuregwu, ogbu bọọlụ kwụsịrị bọọlụ ịchụpụ ha ezi. Kroeshia na-acha Frans ọkụ n'ọkara a. Onye ga-eturu ugo n'etiti Modric na Mbappe? Nkeji 49: Varane egbochiela Perisic imewa ha obi, ebe Lloris tinyere ahụ ya ịkụpụ bọọlụ. Nkeji 48: Rebic ebutela bọọlụ Modric gbara, gbaa shọọtụ gara n'elu poostu mana Lloris kụpụrụ ya n'oge. Nkeji 47: Vsarljko eburula nsogbu gaa n'ihu poostu ndị Frans, mana Lloris kụpụrụ ya. Nkeji 46: E bidola ọkara nke abụọ. Onye ga-emeri asọmpi a ma bulie Iko nke afọ a? A gaala ezumike nkeji 15. Nkeji 45+2: Mandzukic na-achọ ibunye Rebic bọọlụ ka ọ gaa nye goolu, mana Lloris bu ha ụzọ nweta ya. Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji atọ Nkeji 45: Rakitic agbabatala bọọlụ n'ihu poostu, Vid tara ya isi mana ọ banyeghị. Nkeji 43: Pogba egbochiela bọọlụ gaara abanye na neetị ha, ka Lovren bịara igbanye goolu. Nke a bụ egwuregwu Ikpeazụ nke Iko Mbaụwa a na-enye goolu atọ tupu a gaa ezumike nkeji 15, kemgbe nke 1974 dị n'etiti West Germany na Netherlands. Nkeji 41: E nyela Hernandez akwụkwọ edo edo. Nkeji 38: GOOOOLLLUUUU!!!! Griezmann enyela goolu. Nkeji 37: Griezmann ga-agba ya bụ penariti. Nkeji 36: Ogbu bọọlụ ekwuola na bọọlụ ahụ kụrụ Perisic n'aka ma nye Frans penariti. Nkeji 33: France enwetala 'corner', Griezmann agbabala ya n'ihu poostu, ebe a na-achọ iji VAR mara ma ọ kụrụ Perisic n'aka n'ezie. Nkeji 28: GOOOOLLLLUUUU!!!! Perisic enyela goolu. Kroeshia na Frans na-agba 1-1 ugbua. Nkeji 26: E nyela Kante akwụkwọ edo edo. Mandzukic bụ onye bụ ga-enye onwe ha goolu n'ime bọọlụ ikpeazụ nke Iko Mbaụwa. Nkeji 23: Mbappe natara Pogba bọọlụ na-achọ ibu ya agbafu, mana Vida gbapụrụ ya bọọlụ n'ụkwụ. Nkeji 21: Modric gbara bọọlụ ahụ, mana ọ kụrụ Vida n'isi pụọ n'elu neetị. Nkeji 20: Modric enwetala 'free kick' ka Kante tinyeere ya ụkwụ. Nkeji 18: GOOOOLLLUU!!! Mandzukic atakpuola goolu na neetị nke ha. Ọ tara isi a ka Griezmann gbara 'free-kick si na ada Brozovic gbaturu ya. Nkeji 11: Kroeshia abịaghị igwu egwu, ha na-acha Frans ọkụ dị egwu. Nkeji anọ: Perisic anapụtala onye Frans bọọlụ, gawa n'ihu poostu, mana Varane napụtara ya bọọlụ tupu Umtiti agbafuo ya. Otu Nkeji: E bidola asọmpi ikpeazụ a n'ọgbọ egwuregwu Luzhniki. Didier Deschamps oge ọ bụ onye ọgba bọọlụ na ugbua ọ bụ onye nchịkọta Didier Deschamps nwere ike ịza aha na naanị mmadụ atọ buliri Iko Mbaụwa dịka ọgbaa bọọlụ nakwa onye nchịkọta. Deschamps bụ kaptịn n'afọ 1998 oge Frans buliri Iko Mbaụwa. Otu Frans agbanweghị ndị meriri Beljiọm n'agba ọkara-ikpeazụ, Kroeshia n'onwe ha agbanweghịkwa ndị nke ha. Mbappe ga-abụ onye atọ pekarịchara mpe ga-eso n'asọmpi ikpeazụ nke Iko Mbaụwa, ọ tọrọ naanị Pele nke Brazil n'afọ 1958 nakwa Giuseppe Bergomi nke Itali n'afọ 1982. Ndị nọ n'oche Frans: Prensel Kimpembe, Thomas Lemar, Ousmane Dembele, Corentin Tolisso, Steven N'Zonzi, Steve Mandanda, Adil Rami, Nabil Fekir, Djibril Sidibe, Florian Thauvin, Benjamin Mendy, Alphonse Areola. Ndị Frans bidoro bọọlụ: Hugo Lloris; Benjamin Pavard, Raphael Varane, Samuel Umtiti, Lucas Hernandez; N'Golo Kante, Paul Pogba; Kylian Mbappe, Antoine Griezmann, Blaise Matuidi; Olivier Giroud. Ndị nọ n'oche Kroeshia: Dominik Livakovic, Vedran Corluka, Mateo Kovacic, Andrej Kramaric, Lovre Kalinic, Tin Jedvaj, Filip Bradaric, Duje Caleta-Car, Milan Badelj, Marko Pjaca, Josip Pivaric. Ndị Kroeshia bidoro bọọlụ: Danijel Subasic; Sime Vrsaljko, Dejan Lovren, Domagoj Vida, Ivan Strinic; Ivan Rakitic, Marcelo Brozovic; Ante Rebic, Luka Modric, Ivan Perisic; Mario Mandzukic. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51354015,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354015,Arthur Agwuncha Nwankwo: Onye bụ odeakwụkwọ a?,Onye odeakwụkwọ a ma ama bụ Arthur Agwuncha Nwankwo anwụọla.,"Ọ nwụrụ n'ụbọchị satọde, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Febrụwarị 2020, n'ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH) nke dị n'Enugwu steeti dịka ọ gbara afọ 77. Tupu ọ nwụọ, ọ rụrụ ọrụ na National Democratic Coalition (NADECO) dịka onyeisioche ha. Nke a mere ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma zigara ezinaụlọ ya ozi itiakanobi site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina. Content is not available End of Facebook post, 1 Gọọmentị Anambra steeti kwanyekwara ya ugwu ikpeazụ. E ji ụfọdụ akwụkwọ dịka ""Danda"" nakwa ""Tales out of School"" were mara ya. Ihe ndị ị maghị maka Arthur Agwuncha Nwankwo Otu ndị ọzọ o so na ya gụnyere PMP, People Progressive Party (PPP) nakwa ụlọ mbipụta ọzọ o hibere bụ Nwamife Publishers dị n'Enugwu. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Toni Kan bụ onye ode akwụkwọ ọnụ na-eru n'okwu" afirika-50564323,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50564323,Igbo Reincarnation: Aha ndị na-egosi na Igbo kwenyere n'ịlọ ụwa,"Nkwenye Igbo gbasara ala mmụọ dị ọtụtụ nke gụnyere ịnọ ụwa, amosu nakwa ọgbanje.","Ịlọ ụwa dịka J.A.S. Nwankwo bụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara omenala Igbo kọwara pụtara nkwenye na mmadụ nwụọ, ọ na-alaghachite n'ụwa bie ndụ ọzọ. Otu ụzọ Igbo si egosipụta nkwenye a bụ site n'ịgụ mmadụ aha gosiri na ọ bịara ụwa mbụ, nwụọ ma laghachite. Mana tupu a baa aha o nwere ụzọ esi a ma ma mmadụ a bịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa. Etu e si achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa Maazị Nwankwo kwuru na ""o doro anya na Igbo kwenyere na ịlọ ụwa"". Maazị Nwankwo nyekwara ụzọ dị icheiche esi achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa. - A mụọ nwa ọhụrụ a ga gbaa afa maọbụ gbaa agụ n'ụlọ dibia ịmaata onye ọ lọrọ. - Apa na-adị nwa ọhụrụ n'ahụ yiri nke onye ọ nọrọ ụwa bu n'ahụ ya. - Omume maọbụ njirimara onye ahụ nwụrụ anwụ dịka ọrụsị aka maọbụ ọrụsị ụkwụ. - 'Ike ekpe' ya bụ ihe ndị onye ahụ nwụrụ kwuputara na ndụ mbụ ya ọ ga-eme ma ọ laghachite ụwa ọzọ. Aha ndị na-egosi echiche na mmadụ nọrọ ụwa Ọnọchie pụtara Nnaanọchienobi. Nnamdi pụtara Nnamdindụ. Nnennia maọbụ Nnenna. Nnedi pụtara Nnem dị ndụ be m. Obele - Ọ bụrụ na mmadụ lọọ gị, a ga na-akpọ gị Obele aha onye ahụ dịka 'Obele Okeke' maọbụ 'Obele Mgborie'. Kedụ aha ụtọ ị na-etu onye ị hụrụ n'anya? Nwannia pụtara Nwa nna ya maọbụ Nwanyị nna ya. Nwadinobi pụtara Nwa bịara n'obi be nna ya. Nwabia maọbụ Nwabiara pụtara Nwa bịara ụwa be nna ya. Obiekunyie pụrụiche n'ihi na ọ bụ ndị agbụrụ ha na-akwado imechi tupu a mụọ nwa ahụ na-aba aha nke a. Maazị Nwankwo kwuru na nkwenye Igbo n'ịnọ ụwa abụghị nkwenye nkịtị na ọ bụ ndụ ha na-ebi. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-53926995,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53926995,Etu soshal midia si mee ka ọ dị mfe ire ọgwụ ike,Ị hụtụla onye ọgwụ ike na-enye nsogbu maọbụ onye o gburu?,A chọpụtala na e nwere ụzọ ndị omekome na-esi eji soshal midia eresị ndị mmadụ ọgwụ ike ha. Nchọpụta a gosikwara ihe ndị ụlọọrụ soshal midia gụnyere Snapchat na Instagram na-eme gbasara ya. Ezinaụlọ ndị ụmụ ha na ụmụnne ha si na soshal midia zụrụ ọgwụ ike a kwuru na ha chọrọ ka ndị ụlọọrụ soshal midia ndị a gbakwuo mbọ hụ na ha kpachiri ụzọ niile ndị omekome a si eme ihe a. Kedụ ihe ndị uweojii nwere ikwu maka ya? Chọpụta site n'ile ihe nkiri a n'uju ebe a: afirika-49131205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49131205,"Ndị dọkịta India achịpụtala ego igwe, ọla, n'ime afọ nwaanyị na-eri ya",Ihe mgbagwoju anya mere n'otu ụlọọgwụ n'India dịka ndị dọkịta chịpụtara ngwongwo na ngwongwo n'ime afọ otu nwaanyị.,"Ndị dọkịta chịpụtara ihe nyịruru kilogram 1.5 gụnyere ma ọla nakwa ego igwe, n'ime afọ nwaanyị ahụ n'ụbọchị Wenezde, Julaị 24. A kpọtara nwaanyị ahụ n'ụlọọgwụ ka nne ya chọpụtara na ọtụtụ ihe na-efu n'ụlọ ha, ma ghọta na ọ na-agbọkarị agbọ oge ọbụla o richara nri. Dịka nne nwaanyị a siri kwuo, ahụ adịchaghị nwa ya nwaanyị (ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ isi), nke mere ka ha na-elekọta ya n'ime ọnwa abụọ ọ na-arịa ọrịa, mana ọgwụ e nyere ya arụghị ọrụ. Nwaanyị ahụ na onwe ya kwuru sị na ọ bụ agụụ mere o ji na-eri ihe dịka ọlantị nakwa ego igwe na ihe ndị ọzọ. Gịnị na gịnị ka e wepụtara? Siddharatha Biswas bụ onyeisi ngalaba ndị na-awa ahụ n'ụlọọgwụ Rampurhat Government Medical College, kwuru na mgbakọ ego igwe ha chịpụtara pụtara 90. O kwukwara na ha chịpụtara ihe ndị dịka ọla a na-agba n'imi, ọlantị, ọlaaka, elekere mgbanaka, ọla a na-anya n'olu nakwa ihe ndị ọzọ. Kama ndị dọkịta kwuru na ha na-ele ya ọrịa dịka onye na-arịa ọrịa ụbụrụ isi. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị" 43544397,https://www.bbc.com/igbo/43544397,Mavrodi bụ onye bidoro MMM anwụọla,"Ka Sergei Mavrodi bụ onye bidoro ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM), nwụrụ taa, ndị mmadụ ekwuputala uche ha gbasara ọnwụ ya.","Sergei Mavrodi ruru afọ 62 tupu ọ nwụọ Mavrodi dị afọ 62, nwụrụ taa n'obodo Moscow, ka ndị dọkịta kwuru na nkụchi obi (heart attack) gburu ya. Tupu ọ nwụọ, Mavrodi bụ onye mba Rọshịa a ma-ama n'ihe gbasara ịghọgbu ndị mmadụ ma nara ha ego ha, nke ndị bekee kpọrọ ponzi scheme, kpara ọtụtụ ego. Ngalaba MMM nke bidoro ọrụ na Naịjirịa n'afọ 2015, kwụsịrị ịrụ ọrụ n'ọnwa Disemba nke afọ 2016 ka ihe ruru mmadụ nde abụọ na puku narị anọ bidoro iji ya enye ma kpata ego. Ha kwuru na ihe kpatara ha ji kwụsị ọrụ bụ maka ""ndị mmadụ ka nkụ n'elu sistem anyị nakwa anya ọjọọ ndị gọọmentị na ndị ntaakụkọ ji ele anyị"" Ihe ndị Naịjirịa na-ekwu gbasara ọnwụ Mavrodi Ụfọdụ kwuru na ọ bụ 'ekpere' ndị Naịjirịa ego ha furu n'ime MMM kpere kpatara o jiri nwụọ Ebe ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ aghụghọ ka ọ ghọrọ Ụfọdụ kwuru na ọ bụ ụjọ ihe ndị Naịjirịa gaara eme ya mgbe ha ga-abịa ile asọmpi iko mbaụwa na Rọshịa bụ ebe Mavrodi si, mere o jiri nwụọ iji gbaara nsogbu ọsọ. Ụfọdụ chetara ego ha furu efu n'ime MMM. Ha jụrụ ihe ga-eme ego ha ugbua Mavrodi nwụrụla Ihe amabeghị ugbua bụ ihe ọnwụ Mavrodi ga-apụtara ndị ka nwere nchekwụbe na MMM ga akwụ ha ụgwọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44366671,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44366671,Saraki: egwu ndị uweojii adagharịala,Egwu ndị uweojii adagharịala maka ihe ha gwaburu onyeisi ndị ụlọ omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ya were ọsọ were ije bịa zaa ha oku maka ịkọwa ka ya na ije siri gaa maka ohi ndị ojiegbeezu gara n'Offa n'ọnwa Eprelu.,"E boburu Saraki ebubo ohi,mpụ na ihe ndịọzọ Ugbua ndị uweojii sịzị Saaraki ya abịazịla, ma ya zite akwụkwọ ga-akọwa ka ya bụ ohi ezuru siri metute ya. E nyedebere ya echi bụ Wenezde maka izite ya bụ akwụkwọ. Cheta n'ụbọchị uka gara aga na ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood kwuru na ndị ohiegbe Offa ahụ kpọrọ Saraki na Gọvanọ Kwara steeti bụ Abdufatah Ahmed aha dịka ndị na-akwado ha. Sarakị n'onwe ya sịkwara n'obi siri ya ike na-ịza ya bụ oku ndị uweojii kpọrọ ya tupu ya nwetazịa akwụkwọ nke sị ya ya mezie nkọwa n'akwụkwọ. N'onu ya Saraki dere "" dịka m dere n'akara twitter mbụ, enwetala m akwụkwọ ndị uweojii jiri sị m kọwa ihe m maara maka ya bụ ohi Offa na akwụkwọ nke m ga-ezitere ha na mkpụrụ ụbọchị abụọ, nke m ga-eme"". Nke a mechara ka onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris, onyeisi ndị DSS, lawal Daura nakwa onyeisi ndị ọkaikpe bụ Abubakar Malami (SAN) na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo nwechara mkparịta ụka nzuzo na ụbọchị Mọnde n'obi onyeisiala n'Abuja. Kepụkepụ ndị nta akụkọ nụrụ na-akọwa na ya bụ mkparịta ụka nwere ka ọsi gbasatụ ebụbọ a eboro Saraki. Mana akwụkwọ ozi Punch kwuru na mgbe ha gara ịjụ onyeisi ndị ụweojii ihe akpatara na ya bụ ọgbakọ na ọnweghị ihe ọzara ha. Akwụkwọ akụkọ a na-ekwukwa na ọ dịka nwepu ewepuru ndị uweojii na-echekwa ndị isi omeiwu a kpatara osote onyeisiala jiri kpọ ha oku a. Na agbagheghị, onye ndụmọdụ Sarakị na ihe gbasara ọchịchị onyekwuo uche ya bụ Kingsley Amaku kwara BBC ụnyahụ na-eziokwu atọgbughị na ya bụ okwu. Ka nke a na-eme ndị nPDP akatọla ya bụ ebubo a ana ebo Saraki na Ahmed. Onyendụ ha bụ Alhaji Kawu Baraje kwuru na ha agaghịzị enwe ya bụ mkparịta ụka nke ha na otu APC na onyeisiala, Buhari chọrọ ịnwe. Cheta na ndị nPDP na osote onyeisiala bụ Osibanjo hụru n'izu gara aga ma kwekọrịtakwa ihụ ọzọ ụnyahụ bụ Mọnde. Mana ihe ndị a mere gosiri na ndị APC adịghị nkwadobe ịme ka ya bụ ọgbakọ wee isi, dịka Baraje siri kwuo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43442986,https://www.bbc.com/igbo/43442986,A chụrụ osote onyeisi ndị FBI n'Amerịka Andrew McCabe,"A chụọla McCabe, osote onyeisi otu nyocha mba Amerịka nke a kpọrọ FBI n'aha ịchafụ ka ọ fọrọ abalị ole na ole ka ọ laa ezumike nka.","Andrew McCabe bụ osote onyeisi FBI bụ Comey onye Trump chụrụ n'afọ gara aga Onye isi ngalaba na-ahụ maka ikpe na mba Amerịka bụ Jeff Sessions, kwuru na nchọpụta e mere gosiri na o zipuru ozi ma megharịa ndị na-eme nyọcha anya. McCabe gọrọ agụgọ na ebubo ahụ achịtaghị aja kama ọ sị na a na-elegide ya anya n'ihi na ya sonyere na-ime nyocha na Russia tinyere aka na ntuliaka afọ 2016. Ihe merenụ bụ: ""E chere na ihe mere eji mee m otu a bụ n'ihi ọrụ m rụrụ, ihe m mere, na ihe mere n'anya m ka achụchara James Comey n'ọrụ."" Trump chụrụ Comey n'ọrụ dịka onyeisi FBI n'ọnwa Mee afọ gara aga maka otu ọ sịrị mee nyocha ozi igwe nke a kpọrọ email nke Hillary Clinton mana o mechara gụnye 'ihe gbasara Russia dịka ihe so kpata ọchụchụ ya. N'onwe ya, Comey na-enyocha ebubo na ndị ọrụ Trump na ndị Russia nwere nkwekọrịta nyere Trump aka imeri na ntuliaka afo 2016. O gwakwara ndị ụlọomeiwu sineti na onyeisiala rịọrọ nkwadọ ya. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-ebo McCabe ebubo na ọ kwadoro ndị otu pati Demokrats. O toro Sessions' maka ichụ McCabe n'ọrụ. N'ọnwa Disemba, Trump mere ka o ji McCabe eme akaje mgbe o kwuru n'igwe okwu Twitter sị: ""Elekere osote onyeisi FBI bụ Andrew McCabe na-akụ kwapụkwapụ mgbe ọ ga ala ezumike nka. Abalị ịrị itolu ka ọ fọrọ?!!!"" Ihe ejiri chụọ McCabe A na enyocha ya bụ McCabe maka etu FBI si lebanye anya na nyocha abụọ nke e mere oge ntuliaka onyeisiala nke e mere n'afọ 2016 na onyinyo a na-enyo na Russia tinyere aka ime ka Trump merie na ntuliaka ọkwa onyeisiala. Ọ rịturu n'ọkwa ya dịka osote onyeisi FBI iji nye ohere maka nyocha ahụ ma na-eche ịla ezumike nka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44190026,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44190026,Ihe ndị mmadụ kwuru maka agbamakwụkwọ Harry and Meghan,Agbamakwụkwọ Ọkparaeze Harry na Meghan Markle kpalitere ọtụtụ akụkọ n'etiti ndị Naịjirịa.,"Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Agbamakwụkwọ a so n'otu ihe 'jikọrọ' ọtụtụ ndị Naịjirịa, maka na o buteere ọtụtụ n'ime ha obiaṅụrị nke mere ka ha kwado 'ụdịrị ịhụnanya' dị n'etiti ha. Ebe ụfọdụ na-ekwu na ịhụnanya a dị ụtọ n'anya ma na ntị, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ihe ọma nye ndị isi ojii. Cheta na Meghan ji afọ atọ tọ di ya, ma bụrụ onye ya na onye ọ lụbụrụ mbụ gbara alụkwaghịm, lụrụ Harry bụ nwanwa Ezenwaanyị Elizabeth nke Briten. Meghan bụ onye mba Amerịka bụzị 'Duchess of Sussex' site n'ịlụ Harry bụ 'Duke of Sussex'. Ihe ndị mmadụ kwuru BBC gara na soshal midia ịhụ ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka agbamakwụkwọ a. Otu onye kwuru na ịhụnanya ọ hụrụ gụrụ ya anya mmiri. Ụfọdụ kwuru etu Harry sị kwe lụọ onye tọrọ ya. O jikwa ya tụnyere ụdịrị ọnọdụ ahụ na Naịjirịa. Ụfọdụ gụrụ ya aha ndị Naịjirịa. Onye ọzọ kwuru na Ọkparaeze Harry yi ụdịrị uwe o ji gbaa akwụkwọ nke ya n'afọ anọ gara aga. Ụfọdụ kwuru na ọ bụ ebumnobi ha na ọ ga-eme ka ụmụnwaanyị ghara ite ihe n'ihu ha ụbọchị agbamakwụkwọ ha. Ụfọdụ jikwa ohere ahụ tụnyere agbamakwụkwọ a na ụdịrị nke nwere ike ime na Naịjirịa. @Dr_Aphiz kwuru sị na ọ hụrụ na Theresa May bụ praịm minista abịaghị, mana ọ bụrụ na Naịjirịa onyeisiala na ndị ọzọ ga-abịarịrị." afirika-48102708,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48102708,2019 Budget: Ụlọomeiwu ebinyela aka na bọjetị $29.3bn,Ego niile gọọmentị ga-emefu pụtara nde dọlla iri abụọ na itoolu ($29.3b) dịka akwụkwọ mkpata na mmefu ahụ kwuru.,"Ụlọomeiwu ukwu tinyesoro ego n'ego nke gọọmentị etiti kewapụtara a ga-eji rụ ọrụ na Naịjirịa n'afọ 2019. Ụlọomeiwu nta ga-ebinye aka na ya bụ akwụkwọ bọjetị tupu o nwee ike ghọrọ iwu na ala Naịjirịa. Na mba ofesi Mba Venezuela yiri ọgbọ gụ ugbua dịka igwe mmadụ dapụtara ngagharị iwe. O bidoro dịka onye anọghị n'ọchịchị bụ Juan Guaido kpọro oku ka ndị mmadụ pụta mee ya bụ ngagharị iwe. Ndịagha na ndị mmadụ nkịtị kwatara ya n'isiobodo mba ahụ bụ Caracas. Gọọmentị mba ahụ ekwuola na ha na-agba mbọ apịatụ ya bụ ọnwụnwa ịchutu onyeisiala Nicholas Maduro n'ọkwa. Na mba Spen... A họpụtala Luc Andre Diouf bụ onye mba Senbegal dịka onye mbụ si mba ya ga-anọchi anya ndị mba Spen n'ụlọomeiwu ukwu ha. Ọ ga-anọchita anya obodo Las Palmas n'okpuru Socialist Party na mba Spen. Chukwueze a ga-aza oku Naịjirịa? Dịka a na-akwado iko mba ụwa na mba Poland, Samuel Chukweze bụ onye ọgba bọọlụ Villareal azabeghi oku a kpọrọ ya bịa soro na ndị ga-anọchi anya Naịjirịa. Onye nkuzi otu obere Naịjirịa U-20 bụ Paul Aigbogun bụ onye kpọrọ ya na ndị ọzọ bịa gbaara Naịjirịa bọọlụ. Akụkọ BBC Igbo na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ụgbọoloko akwụpịala ndị mmadụ Ihe ruru mmadụ anọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọoloko dịka ụgbọoloko kwọpịara ọgbatumtum keke n'isi ụtụtụ Tuzde 30 Eprelụ afọ 2019. Mkpamkpa a mere dịka ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke ụtụtụ n'ebe akpọrọ Iju Ishaga dị n'ime Legọs. Akụkọ kwuru na ọgbatumtum keke a bu ndị mmadụ chọrọ ịgbafe n'okporo ụgbọoloko mgbe ọ tọọrọ ma ụgbọoloko a akwụpịasa ya. Akụkọ na-abịa n'uju. Ndịgbo agbawala ọsọ onyeisiala 2023? Ụmụ Igbo azọpụla njem iji hụ na ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023 agaghị abụ ihe akụkọ nyere ha. Njem a kpọrọ ""Southeast for President 2023 Movement"" bụ nke ọtụtụ otu nọ n'ala Igbo jikọtara aka ọnụ hiwe, ga-amalite ọrụ taa n'Enugwu steeti. Ndị nọ n'ime otu a gụnyere ndị gụrụ ezi akwụkwọ, ndị azụmaahịa, ndị ndu okpukperechi, nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. Ihe mere ha ji ehiwe otu a bụ ka a hụ na Ndigbo nwere otu mkpebi n'ihe gbasara ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 agbanyeghi pati onye ahụ nọ. PDP na-arụ Inec aka ebubo Pati PDP na ụlọọrụ Inec na-atụ onwe ha aka n'ihu dịka PDP boro ha ebubo ịgbanwe igwe ""Server"" Kọmputa iji kpochapụ nrụrụaka ha mere na ntuliaka onyeisiala. Mana Inec ekwuola na ebubo a achịtaghị aja ọbụla na ọ bụ n'ụlọikpe ka a ga-ama nke bụ eziokwu. N'ofesi Eze ukwu nke mba Japan bụ Akihito bụ onye gbara afọ iri asatọ na ise, ga-agbatu n'ocheeze taa iji nye nwa ya ohere ọchịchị. Akihito ga-abụ onyeeze mbụ mere nke a n'ime ihe karịrị afọ narị abụọ, emume a ga-amalite site n'ịchụ aja dị iche iche. N'egwuregwu Onye na-agbara Real Salt Lake nke dị na Mba Amerịka bọọlụ bụ Nedum Onuoha, ekwuola na Zlatan Ibrahimovic yiri ya na ọ ga-emerụ ya ahụ n'egwuregwu ha na LA Galaxy gbara. O kwuru na Ibrahimovic nwere ọnụ ọjọọ na ọ gaghi anabata arịrịọ mgbaghara ọ rịọrọ ya. Gere akụkọ BBC n'otu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ụmụnwoke Kenya na-akwụ ụdọ" afirika-45417837,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45417837,Salisu Yusuf nara aka azụ $1000 ga-akwụ nha $5000,Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Naịjirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) dara Salisu Yusuf nha $5000 ka a chọpụtara na ọ na-ana aka azụ n'isi ndị ọgba bọọlụ.,"Salisu Yusuf kpọ ndị Super Eagles na-agba n'ụlọ gaa asọmpi CHAN n'afọ 2017 ebe ha ruru agba ngwụcha NFF nyere iwu sị ka Yusuf sepụ aka n'ihe niile gbasara egwuregwu bọọlụ n'ime otu afọ. Na-erughị ọnwa ole na ole gara aga, BBC African Eye wepụtara ihe nkiri otu onye ntaakụkọ Ghana bụ Anas Arameyaw Anas, sere na nzuzo gosiri ka Yusuf na-ana 'onyinye' puku dọla ($1000), iji hụ na ọ kpọrọla ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ gaa asọmpi mpaghara Afrịka nke 2017. NFF kwuru na Yusuf ji anya ọcha ya nara ego ahụ; na omume ya mechuru ngalaba ha ihu makana o kwesịrị ịkpazi agwa ọfụma, ọkachasị maka aka o binyere n'akwụkwọ usoro akparamagwa nke dị n'akwụkwọ nkwenye e ji wee ya n'ọrụ. Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego Ha kwukwara na mmadụ abụọ e ji megharịa ya anya na a chọrọ ka ọ họrọ bụ Osas Okoro na Rabiu Ali, gaara esonyekwa ndị otu ha gaa ya bụ asọmpi n'agbanyeghi ego ahụ Yusuf narala, maka ""ọnatarachi na ịgba ọfụma ha"". N'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara, NFF kwuru na ọ ga-akwụ nha puku dọla ise a dara ya tupu ọnwa atọ agachaa. Colins Udoh bụbu ọnụ na-ekwuchitere ndị Super Eagles tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47272114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47272114,Kajuru Killing: Ndị uweojii na NEMA amaghị maka mmadụ 66 'nwụrụ' na Kaduna,Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha enweghi ike ịkọwanwu ugbua ma mmadụ 66 anwụrụ n'ezie n'okpuruọchịchị Kajuru dị na Kaduna steeti.,"Yakubu Sabo bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kaduna steeti, gwara BBC na kọmishọna uweojii ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ya taa. BBC kpọkwara Ishaya Chinoko bụ onye na-elekọta mpaghara ugwu-ndịdaanyanwụ nke ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ ""National Emergency Management Agency (Nema), onye kwuru na ha amaghị na ụdịrị ihe ahụ mere . O kwuru sị ""dịka m na-agwa gị okwu ugbua, Anọ m na Kaduna steeti mana anụbeghi m ihe dị otu ahụ na mmadụ 66 nwụrụ. ""Ọrụ anyị bụ ilekọta ndị a gbara ọsọndụ, nke bụ na ọ bụrụ na ihe ruru mmadụ ole ahụ nwụrụ, ndị mmadụ gaara agbapụta n'ogige ahụ nke ga-eme ka anyị wụchie."" Ọkammụta Chidi Odinkalu bụbụ onyeisioche otu na-ahụ maka ikike dịrị onye nke a kpọrọ ""National Human Rights Commission"", tinyekwara ọnụ ya n'okwu a na Twitter, ebe o kwuru na o cheghi na ihe dị etu a mere. Mana El-Rufai tinyere na Facebook ya, foto ọ sị na-egosi ka ya na ndị agha gara mgbaru n'obodo ahụ e gburu ya bụ mmadụ 66. Cheta na El-Rufai kwuputara n'ụbọchị Febrụwarị 15 na mmadụ 66 nwụrụ na steeti ya. Akụkọ ga-amasị gị:" 42965728,https://www.bbc.com/igbo/42965728,Tinubu si na ya amaghị maka ọrụ ọhụ APC enyere ya,Bola Tinubu agbarala isi onwe ya ka Muhammadu Buhari kpọchara ya aha ịbụ onye okpeudo n'etiti ndị nọ n'otu pati APC.,"Bola Tinubu bụ onyeisi nchịkọta otu pati APC Maka ịchọpụta ụzọ a ga-esi akwụsị ndị mmadụ isi na otu pati APC pụọ, onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari họpụtara Tinubu ka ọ nọrọ n'ọnọdụ onye ga-ahazi ma gbaa mbọ ịhụ na udo dị n'ime pati ha. Okwuru na ụfọdụ ihe ọ ga-eme bụ ịkwụsị esemokwu dị n'etiti ndị otu ha, ndị isi otu ha na ndị ji ọkwa ndọrọndọrọ n'ụfọdụ steeti dị na Naịjirịa. Kama Tinubu gọrọla aka ya n'ime ihe gbasara okwu a Buhari kwuru na social media: End of Twitter post, 1 Ihe Tinubu kwuru Ka BBC kpọkuru otu onye na-ekwuchitere Tinubu ọnụ bụ Tunde Rahman, o kwuru sị na onwebeghi ihe ha nụrụ. Ọ sị ""Anyị enweghị ike ikwu ihe ọbụla gbasara ya ugbua maka na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ejibeghi aka ha gwa Tinubu ihe ọbụla. Nanị n'ime akwụkwọ mgbasa ozi ka anyị si na-anụ ya. Anyị jiri aka anyị nụ n'ọnụ ndị nọ n'ọkwa ọchịchị, anyị ga-enwezi ike kwuputa."" Ihe nke a pụtara Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara pọlitiks bụ Lasisi Olagunju kwuru sị na ""ọ bụ ihe na-agaghị enwe isi ma ncha""" afirika-50463491,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50463491,Nigeria to Dubai: Ihe na-akpọga ndị Naịjirịa Dubai,"Dubai bụ ezigbo ọzara ihe dịka afọ 50 gara aga, mana ugbua ọ bụzị obodo ụwa niile na-eto maka ọganihu na mmepe obodo.","Dubai nwere ụlọelu kachasị ogologo na mbaụwa niile bụ nke a na-akpọ Burj Khalifa Obodo a dị na mba United Arab Emirates (UAE), ebe ọ bụ isiobodo Dubai Emirates. Ọ bụ Sheikh Rashid bin Saeed Al Maktoum malitere ịchị Dubai n'afọ 1958 bụ onye malitere mmepe Dubai, mana mmanụ agbịdị achọtara n'obodo ahụ n'afọ 1966 nyerela ha ezigbo aka. Ego mmanụ agbịdi a banyere ọrụ were mee Dubai ihe ọ bụ ugbua. Ihe mere ndi Naịjirịa ji awụba Dubai Onye na-anọchịte anya Dubai na Naịjirịa bụ Dọkịnta Fahad Al Taffaq, kwuru na ihe ruru mmadụ nde iri na ise (15m) na-aga obodo ha kwa afọ. Ọtụtụ n'ime ndị a na-aga Dubai bụ ndị Naịjiria. Mana gịnị ka ndị mmadụ na-achọ aga mba ahụ? Lee ihe ndị anyị chọpụtara na-akpọga ha. 1) Dubai na-anabata ndị mmadụ Al Taffaq sị na ọ bụ etu ndị obodo ahụ si anabata ndị Naịjirịa mere ha ji abịa ebe ahụ n'ike n'ike. Ọ sị na ihe ruru ndị si mba 200 bi na Dubai na-akpọ ya be ha nke abụọ. Dubai bụ ebe e si aga mba dị iche iche. Taata, Dubai bụ ihe Bekee na-akpọ ""hub"" e si aga Chaịna, Indịa, na mba dị iche iche. Al Taffaq sị; ""Anyị na-akpaso ndị mmadụ agwa ka ha abụ mmadụ, agbanyeghị ebe ha si bịa na ofufe ha. Ihe a bụ etu anyị dị."" 2) Dubai bụ nnukwu ahịa Davido na Zlatan bụ otiegwu na Naịjirịa gara gbaa ndị Dubai ezigbo aka ahịa Na Dubai, ịzụ ahịa bụ ihe dịrị ndị mmadụ mfe. Onye ọbụla chọrọ ịzụ ahịa ga-ahụrịrị ebe ọ ga-anọ zụọ ya n'obodo ahụ. Ọtụtụ ndị na-aga ebe ahụ na-ekwu na ngwaahịa adịghị ada oke ọnụ ebe ahụ. Ọzọkwa bụ na ha na-emekarị ihe Bekee na-akpọ ""sales"". Nke a bụ oge ndị na-azụ ahịa na-ewetu ego ngwaahịa iji mee ka ọtụtụ mmadu bịa goro ha. Gọọmentị Dubai na-emekwa ihe niile ha nwereike ime iji hụ na azụmahịa na-aga etu o si kwesi. 3) Dubai bụ ebe a na-aga nlegharị anya Ọkụ dị n'ụlọelu Burj Khalifa na-agbanwe ma a na-enwe nnukwu mmemme kwa mgbe Dubai mepere ọfụma nke mere ọtụtụ mmadụ ji na-abịa ya ime nleghari anya. Ụfọdụ ji maka ya ekwu sị ""ebe obodo a mara ụdịrị mma a, kedụ ka eluigwe ga-adị"". Ụlọ kachasị ogologo n'ụwa dị na Dubai. Ha chọkwara obodo ahụ mma nke ukwu ma na-edowe ya ọcha. Nke nwereike na-amasị ndị Naịjirịa bụ na ọkụ latrik na-enwu ebe ahụ gbanyụụ. 4) Ndị Dubai ji ihe ha nwere kpọrọ ihe Dubai nwere ọzara, ebe ihe ọbụla anaghị eto. Ebe ahụ bụ sọsọ aja dị ya, nke Bekee na-akpọ ""desert"". Ha ji ebe ahụ mere ebe ndị mmadụ na-aga eme nlegharị anya nakwa eme egwuregwu, bụ nke ha na-akpọ 'desert safari'. Ha nwekwara ụdịrị ebe Bekee kpọrọ ""Beach"" ha na-edowe ọcha ma na-arụzi ya na-eme ka ịnọ na ha na-agụ ndị mmadu agụụ. Naịjirịa nwekwara ụdịrị ihe ndị a mana ha anaghị edowe ha ọcha maọbụ hazie ha etu o si kwesị. 5) Ihe eji egwuregwu bụ atụrụ tawa n'obodo a I chọrọ isi n'elu ụgbọelu mapụ? Ị chọrọ isi n'elu ụlọ elu mapụ? Ị chọrọ igwu mmiri n'ime osimiri maọbu rahụ n'ụlọ dị n'okpuru mmiri? Dubai nwere ebe a na-eme ọtụtụ ihe ndị a niile na ndi ọzọ dị etu ndi kachasị mma n'ụwa dị. Etu eji achụla ndị mmadụ na Dubai Na-agbanyeghi na Dubai na-anabata ndị mmadụ, ha na-agbarụkwa ihu ma mmadụ merụọ iwu ha. Onye merụrụ iwu ha nwereike hụ onwe ya n'ụzọ nlata. Lee iwu abụọ Dubai nwereike iji chụla mmadụ: 1) Iwu ụlọikpe: Nke a na-efesa ndị dara iwu nwetere ikike ya n'usoro ụlọikpe Bekee kpọrọ ""Legal Deportation"". Dịka iwu UAE siri kwuo, usoro a na-adị ire n'ihe banyere mwakpo mmadụ n'ụdịrị mmetụ ahụ. 2) Iwu gọọmentị: Nke a metụtara ịchụla mmadụ makana ọ bu ihe obodo chọrọ. Ihe nwereike ibute nke a bụ ihe metụtara ahụike obodo, nchekwa nakwa ime arụ. Ndị mbịarambịara na-enweghi ihe ha na-arụ na Dubai nwekwara ike hụ onwe ha n'ụdịrị ọnọdụ ndị agbara akwụkwọ ụla a. Ndi UAE chụo gị, ịlaghachịte mba ahụ ga-ara gị ezigbote ahụ. Ọ bụ nanị Minista na-ahụ maka obodo ga-enyenwu gị ikike ị ga-eji batakwa ọzọ. Gaa ebe a ka ị nwete akụko ndị ọzọ banyere ọchụchụ mmadụ na mba a." 42856094,https://www.bbc.com/igbo/42856094,Ndị oyiegwu IS awakpola ụlọ ọmụmụ ndị agha na Kabul,Otu oyiegwu a na-akpọ Islamic State (IS) sị na ọ bụ ndị otu ha wakporo ụlọ ọmụmụ ndị agha na Kabul.,"Ndị IS na Taliban an akpa ike na Afghanistan A wakporo ụlọ ọmụmụ a na-akpo Marshal Fahim National Defence University n'isi ụtụtụ taa, ozi si mba Afghanistan na-apụta na-ekwu. Mwakpo a na-eme n'azụ nnukwu ogbunigwe etinyere na ime ụgbọala eji ebu ndị ahụ adịghị a na-akpọ ""ambulance"" na asụsụ bekee, gbara wee gbuo mmadụ ruru otu nari. Islamic State na Taliban mere mwakpo di ichiche na Kabul ọhụrụ a. Onye ntaakụkọ BBC Mahfouz Zubaide na-akọwa na ụda egbe na ogbunigwe kpọnyitere ndị Kabul na elekere ise ụtụtụ nke be ha. Ndị ọrụ nchekwa mechiri ụzọ niile esi eje ma pụta na-ebe ihe a na-eme, ọlụ ntaakụkọ a na-akpọ Tolo na ekwu. Map Afghanistan Tolo sịkwa na onye na-ekwuchitere onyeisiala Afghanistan kwenyere na onwere ihe mere na mba ahụ, ma sịkwa na ndị oyiegwu ahụ kpara ike a agafeghị onụ ụzọ nke mbụ ha. Ụlọ ntaakụkọ AFP n'onwe ha na-ekwu na ndị uweojii si na ogbunigwe elu so na ihe eji mee mwakpo a, ma n'ekwu na ebe niile adaala jụụ. Ozi ọhụrụ pụtara na-akọwa na ndị nchekwa abụọ na ndị otu oyi egwu atọ nwụrụ na mwakpo a. Ndị agha iri merụrụ ahụ. Anyị ga-ewetara ụnụ ozi ọzọ ma anyị nweta ya." mba-uba-44559059,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44559059,Amerịka achụlatala ụmụafọ Naịjirịa ruru 34,Opekatampe mmadụ 34 bụ ụmụ Naịjirịa ka ndị Amerịka chụghachitere Naịjirịa maka na ha kpara arụ n'obodo ahụ.,E sikwa mba Libya chụlata ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na mbido afọ a Ndị ahụ achụlatara gụnyere ụmụnwoke mmadụ 32 na ụmụnwanyị abụọ. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'ọdọ ụgbọelu Legos steeti bụ Joseph Alabi kwupụtara nke a nye ndị ntaakụkọ. O kwuru na mmad 25 n'ime ndị kpara arụ gbasara ọgwụike ebe ndị ọzọ dara iwu gbasara ndị mbịara mbịara. Alabi kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjịrịa bụ Nigerian Immigration Service (NIS) na Bekee na ndị na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ a na-akpọ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons na ndị uweojii bụ ndị nabatara ndị ahụ achụlatara. Ndị ọrụ njem ụgbọelu nọkwa ebe ahụ soro nabata ha nakwa ndị na-ahụ maka ịkwụsị ibubata na ibupu ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug and Law Enforcement Agency. O kwukwara na otu ndị ahụ dị icheiche debere aha ndị ahụ n'ebe di icheiche tupu e bulaa ha n'ebe ha ana-aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44249507,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44249507,Nọt Koria ka chọrọ nzukọ ha na Trump,Mba Nọt Koria ekwuola na ha ka chọro ka ha na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwee mkparịtaụka.,"Trump na Jong-Un kwesịrị inwe nzukọ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Juun Onye kwuru ihe a bụ onye osote minista na-ahụ maka mmekọ mba ofesi na Nọt Koria bụ Kim Kye Gwan. Maazi Kim kwuru na ndị be ha dị njikere ka ha na mba Amerịka hazie ihe ọbụla gbagwojuru anya etu ọbụla ha siri chọọ. Cheta na Trump kagburu nzukọ ha na Kim Jong-Un bụ onyeisiala Nọt Koria kwesịrị ime n'ọnwa Juun ụnyaahụ. ""Anyị kwadoro mbọ Trump na-agba, bụ nke karịrị ihe ọbụla emere ịhụ na nzukọ a nwere isi,"" Kim kwuru n'ime akwụkwọ ụlọ mgbasaozi nke Nọt Koria zipụrụ n'abalị ụnyaahụ. ""Anyị na-agwa ndị Amerịka ọzọ na uche anyị dị n'ihazi nsogbu anyị na ha nwere etu ọbula ha jiri chọọ ya,"" Minista a kwuru. Mana, n'Amerịka, nkagbu a Trump kagburu nzụkọ a na-ewe ụfọdụ ndị omeiwu iwe. Chuck Shummer, bụ onyeisi ndi omeiwu si pati nke na-anọghị n'ọchịchị akpọrọ 'Democrats' na Bekee, ekwuola na Trump kwesịrị ịhụ na Nọt Koria kagburu nhazi ogbunigwe nuclear. Akụkọ ga-amasị gị:" 45133769,https://www.bbc.com/igbo/45133769,Falz akatọọla NBC maka ịmachi egwu #ThisisNigeria,"Ngalaba gọọmenti na-ahazi mgbasaozi n'ikuku nke a kpọrọ 'National Broadcasting Commission (NBC)', agọọla na ha amachighị egwu otiegwu Folarin Falana ama dịka Falz a kpọrọ #ThisisNigeria na egwu ndị otiegwu ndị ọzọ.","Falz: #ThisisNigeria ebe mmadụ niile bụ onye omekeome Falz katọrọ NBC n'igwe okwu Instagram ya maka idegara ụlọọrụ mgbasa ozi n'ikuku akwụkwọ sị ha kwụsị ịkpọ egwu #ThisisNigeria (Falz), Iskaba(Wande Coal nakwa See Mary, See Jesus(Olamide) n'ihi na ha nwere ""okwu na-asọ oyi na ntị"" nakwa ịda otu ụlọọrụ redio dị na Jọs, nha narị puku naira maka ịkpọ egwu ndị a. Folarin Falana, (Falz) ekwuola na ya agaghị ewezuga ihe nkiri egwu ọhụrụ o tipụtara N'ịkwa emu, Falz kwuru na ""Nke a bụ Naijiria ebe onye ọbụla bụzị onye omekome bụ okwu na-asọ oyi na ntị."" Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuchitere NBC bụ Maimuna Jimada gọrọ na NBC amachighị egwu #ThisisNigeria dịka e si bo na ebubo. O kwuru na NBC ""enweghị ikike ịmachi egwu ọbụla mana anyị nwere ike ịdọ ndị ọrụ mgbasa ozi aka na ntị banyere ihe na-asọ ntị oyi dị n'egwu ụfọdụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ha kwesịrị ime bụ ịga hichapụ akụkụ egwu ndị ahụ adịghị mma na ntị ""mana nke abụghị na ndị mmadụ enweghị ike ịga zụrụ egwụ ndị ahụ ebe o zuru oke kpọọ n'ụlọ ha."" Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi ahụ Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akatọ ụkwụ ahụ NBC zọpụrụ. @Shawnife kwuru na ala anyị a kpọrọ ndị na-ekwu eziokwu asị. @Osacruz kwuru na ha hapụrụ ịmachi egwu na ihe nkiri na-akwado ajọ ihe, machie nke na-ekwu maka nsogbu ndị ala Naijiria na-arịa. @Iam_Abdulaxis jụrụ na dịka a machiri egwu Falz, Naijria ọ ga-aghọkwa nnukwu mba ọzọ? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49956827,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956827,Big Brother Naija: Kedu ihe ndị meriri 'Big Brother' mbụ ji ndu ha eme ụgbu a.,"Dịka Mercy Eke (Lambo) ritere ihe ruru nde naira iri na isii n'emume Big Brother Naija nke 2019, anyi nyochara ndị ritere ụrụ na mmerị Big Brother na mbụ etu ha si eme ugbua.","Efe Ejeba banyere iti egwu dịka o siri kwuo mgbe ọ mechara BBNaija. Ihe emume Big Brother Naija bụ ihe na-amasị ndi Naijiria ma ndị ntoroọbịa ma ndị okenye. O bidoro n'afọ 2006 na Naijirịa ma bụru kwa emume na-ewu ewu mgbe ọbụla emere ya. Gụo akụkọ a ka ị mata mbọ ụfọdụ ha na-agba ugbua. Efe Ejeba Efe Ejeba onye eji 'Based on Logistics"" mara meriri emume BBNaija nke 2017. Efe bụ onye Delta steeti ma bụrụkwa otiegwu. N'agbanyeghị na o nwere asambodo 'Economics', ọ bụ iti egwu masịrị ya. Kemgbe ọ pụtara n'ụlo 'Big Brother', Efe na-enyere aka n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ọkachasị na Jọs ebe o nyere ụmụakwụkwọ oche na ihe ndị ọzọ. Efe na enyere aka n'ihe gbara agụmakwụkwọ O tipụtala egwu dị iche iche ma nke ọhụru ya na Ice prince tiri na nso nso a. Ejeba ka na-arụkwa ọrụ onye obi ọma ma o tinyekwara ego ya dịka onye ojiegoachụego n'ihe dịka Teknụzụ, Agụmakwụkwọ na Ime njem, ma na-agbape ebe esi enweta mmiri (Bore Hole) n'ebe dị iche iche. Miracle Ikechukwu Igbokwe Miracle bụzi ọkwọ ụgbọelu Miracle bụ nwa afọ owerre Imo state bụ kwa onye ọkwọ ụgbọelu. O meriri BBNaija (Double Wahala) n'afọ 2018. Ihe o ritere bụ ego na ngwa rụrụ nde Naịra iri anọ na ise. Miracle kwuru na ọ ga-alaghachị ọmụmụ ịbụ onye ọkwọ ụgbọelu. Ka ọ dị ugbua, Igbokwe abụrụla nke ndị ọkwo ụgbọelu na-akpọ ""Instrument Rated"". Katung Aduwak Katung Aduwak bụ onye na-aghazị ihe ejiji. Katung Aduwak bụ onye mbụ meriri Big Brother Nigeria nke mbụ emere n'afọ 2006. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri atọ na isi, na puku narị abụọ ma agbanwe ya n'ọnụ ego ugbua. Aduwak gara mba Amerịka ebe ọ mụrụ etu esi ahazị ihe ejiji. Ọ mechara lọta Naijirịa mgbe ọ gụchara were hazie ụfodụ ihe ejiji nke gụnyere 'Unwanted Guests' na 'Heavens Hell'. Uti Nwachukwu Uti na eme ihe ejiji ụgbụ a. Uti nwachukwu turu ugo na Big Brother Africa nke afọ 2010 nka akporo 'All Stars'. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma agbanwe ya n'ọnu ego ugbua. Nwachukwu bidoro ime ihe ejiji mgbe ọ mechara Big Brother Africa. O bidoro ime ihe ejiji n'afọ 2011 ma tụrụ ugo n'ime ejiji n'emume 'Golden Icons Academy Movie Awards (GIAMA)' n'afọ 2012 dịka onye kacha eme ihe ejiji. E mere emume a na mba Amerịka. Karen Igho Rakos Karen Igho Rakos bụ onye mbụ meriri 'Big Brother' dịka nwanyị Naịjirịa na kwa nwanyị mbụ n'Afrịka n'afọ 2011. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma a gbanwee ya n'ọnụ ego ugbua. O na-eme ihe ejiji nke gunyere 'Omo Ghetto', 'Keeping my man', 'Tinsel' na ndị ọzọ. Kevin Chuwang Pam Chuwang Pam bụ onye Naịjirịa mbụ meriri 'Big Brother Africa' mgbe o meriri nke a kpọrọ ""Revolution"" n'afọ 2009. O ritere dọla puku narị abụọ ($200,000) dịka onye meriri, ma lụkwaa Elizabeth nwunye ya bụ onye ọ hụtara dịka ha abụọ nọ n'ime ụlọ Big Brother. Ugbua, Kevin bụ ome ejije, o nwere ụlọọrụ na-ahụ maka ime obi aṅụrị, ọ bụ onye ọrụ ugbo, ọ bụ onye oji okwu eri ji (MC), ọ bụkwa onye ojiegoachụego nwekwara ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka n'efu. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri ga-amasị gị Ọka mmụta Boniface Igbenehue" afirika-48229759,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48229759,Benue-Ebonyi land dispute: Wepụtanụ ndị gburu ndị Ebonyị anọ maọbụ... - Ortom,Gọvanọ Samuel Ortom enyela Eze obodo na ndị bi n'okpuru ọchịchị Ado nke nọ n'agbata Benue na Ebonyi steeti abalị asaa ka ha kpọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu mmadụ anọ ndị Ebonyi steeti.,"Samuel Ortom gọvanọ Benue steeti Ọ kwuru na ọ bụrụ na emeghị otu a, na gọọmentị ya ga-achụtu eze okpuru ọchịchị Agila n'ọkwa n'ike. Na nso nso a, e gburu mmadụ anọ ndị Ebonyị so na kọmịti udo nke steeti abụọ ahụ hiwere maka ịkpa udo n' okwu esemokwu ala dị n'etiti ọkpụrụ ọchịchị abụọ dị na steeti abụọ ahụ ka ha na-aga Makurdi maka ọgbakọ ịkpa udo. Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru gọọmenti Benue bụ Terve Akase nwere n'ekwenti, ọ kọwara ""Gọọmenti Benue na Ebonyi gbakọtara ọnụ n'Abakaliki were hiwe kọmịtị maka ịkpa udo. Ka e mechara ọgbakọ nke Abakaliki, e kwesịrị ime ọgbakọ ọzọ na Makurdị. Ọ bụ oge ndị so na kọmịti ahụ na-abịa Markurdi ka ndị a na-enyọ na ha bụ ndị na-akwado ndị Benue chere ha n'ụzọ,gbupụ ha isi."" ""Mgbe Gọvernor Benue bụ Samuel Ortom nụrụ nke a, o nyere iwu ka Eze obodo Agila kwado ndị uweojii ka akpopụta ndị kpara mkpamkpa ahụ."" Mgbe BBC jụrụ ya ihe a ga-eme ndị ahụ ma enweta ha, ọ kwuru na dịka iwu Naijria siri kwu na aga enyefe n''aka ndị uweojii ka akpụpụ ha ụlọikpe ịzara ọnụ ha. N'aka nke ọzọ o kwuru na onye eze ọbụla zoro ndị omekome na aga achụtu ya n'ọrụ n'ike. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44599621,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44599621,Lee ndị na-eti egwu na-akasi D'Banj obi maka ọnwụ nwa ya,Ọtụtụ ndị a ma ama na ndị ọzọ akasiela onye oti egwu bụ D'banj na ezinaụlọ ya obi maka ọnwụ nwa ya nwoke dị naanị otu afọ.,"D'Banj anọghị n'ala Naịjirịa oge ihe a mere Akụkọ kwuru na mmiri riri nwata ahụ a kpọrọ Daniel Adebanjo III n'ụlọ ha ụnyaahụ. Ndị mmadụ gụnyere ndị a ma ama gara n'akara soshal midia ikwupụta nwute ha nakwa ịkasi Dbanj obi. Nwaanyị na-eme ihe onyonyo bụ Funke Akindele dere n'akara ya n'Instagram na ekpere ya na-agara D'Banj na ezịnaụlọ ya maka ọnwụ ahụ. End of Instagram post, 1 Ebe ndị ọzọ na-arụtụaka na ọ bụ site na-akpaghị anya ezinaụlọ ahụ butere ọnwụ ha. Ndị ama ama n'iti egwu nakwa n'ihe nkiri gụnyere Wizkid, Olamide, Banky W, Toke Makinwa, Genevieve nnaji, Wande Coal, Rita Dominic, Funke Akindele na ndị ọzọ so na ndị zigara ezinaụlọ Dbanj ozi. Olamide zitere ozi site n'akara twitter ya kwuru na onweghi okwu ọnụ ọbụla nwere ike ị kpọhachi nwa ahụ ndụ mana ka Chineke gbaa ha ume Wizkid site na twitter kpere ekpere ka Chineke nye ezinaụlọ Dbanj ike. Banky W. kwuru na nke a bụ ezigbo nrọ ọjọọ ma rịọkwa ka Chineke chekwa ezinaụlọ a Genevieve n'akara Instagram na agaghị aghọta ihe mgbu ezinaụlọ na-agabiga ugbu a mana Chineke nye ha obi i di ihe mere. Omotala Jalade kwuru na ọ bụ Chineke na-enye ndị na-enweghi ume ndụ. Ezinaụlọ D'Banj kwuru na ihe mere ha bụ ihe obi mgbawa. Otu onye n'ime ezinaụlọ ha kwuru na ha achọbughị ka akụkọ ahụ pụta chacha maka na ọ bụ ihe obi mgbawa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45237988,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45237988,Ohaneze adọọla Ipob aka na ntị maka ịbu ọnụ,Ngalaba na-ahu maka ọdịmma Igbo niile bụ Ohaneze adọọla otu chọrọ ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa bụ Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) ka ha kwụsị ịkatọ ha maọbụ ịbụ ha na ndịisi ha ọnụ.,"Nnia Nwodo chọrọ nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara nke a kpọrọ 'Restructuring na bekee Ohaneze kwuru nke a na akwụkwọ mgbasa ozi ọnụ onye ndụmọdụ onyeisi John Nnia Nwodo bụ Emeka Attamah zipuru ụnyaahụ. Attamah kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ na ndị Ipob na eji ọnụ awakpo Ohaneze Ndigbo ohere ọbụla ha nwetere. Ọ sị na-agbanyeghị na Nwodo na-agba mbọ ịhụ na ọnaghị ekwugide Ipob maọbụ mekpa ha ahu, mana ihe Ipob chọrọ bụ ịkatọ ya na Ohaneze. Ipob chọrọ ka ekewa Naịjirịa kenye ha mba ha ga-akpọ Biafra O kwuru na agbanyeghị na Ohaneze tinyere ọnụ n'atụmatụ Egwu Eke nke atọ ndịagha Naịjirịa chọrọ ime (ha sị na ha katọrọ atụmatụ a ọfụma site n'ọnụ Uche Achi-Okpaga bụ ode akwụkwọ Ohaneze) Ipob gakwara n'ihu na-ebo ha na onweghi ihe ha kwuru banyere ya. Ohaneze kwuru na atụmatụ Egwu Eke abụghị ihe kwesiri ime n'Igbo ugbua. Ohaneze kwuru na ha achọghị ka ha na Ipob gwụọ ọnụ makana ọbụghị ihe ga-adịrị Igbo mma. ""Ndị Igbo isi ha pụtara kwesiri itinye ọnụ n'okwu a hụ na-adọrọ Ipob aka na ntị. Cheta na Ipob na Ohaneze nwere nkwekọrịta ịhụ na udo dị n'etiti ha, mana Ipob kagbụrụ ya ma kwuo na ha chọpụtara na ọbụghị ihe ha chọrọ ka Ohaneze chọrọ. Lee ihe otu n'ime ọnụ na ekwuru Ipob bụ Innocent Chukwudi Peace kwuru banyere nkagbu ahụ ha mere nkwekọrịta ahụ. Ụkọchuku Peace: Chịneke ga-eji Buhari wetara anyị Biafra Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42985389,https://www.bbc.com/igbo/42985389,"Naijiria etinyela udu mmanụagbịdị 225,000 n'ihe a na-emepụta",Emechiburu ebe a na-egwupụta mmanụ agbịdị na Bonga iji nye ohere maka nrụzi.,"Mmanụ agbịdị Naijiria na-egwupụta gbagoro kemgbe ndị agha nnupụisi Naija-Delta belatara mkpamkpa ha na-akpa na mpaghara ahụ Dịka akwụkwọ akụkọ Vanguard sir kwuo, ọ bụ Shell, ụlọọrụ na-egwupụta mmanụ mere nrụzị ahụ nke mere ka ha na egwupụtazi udu mmanụ dara karịa nde dola isii n'ọnụ ọ dara n'ahịa mmanụ ugbua. Dika ozi siri kwuo, udu mmanụ ruru otu nde(one million barrels) hapụrụ ọdụ mmanụ nke Bonga na ime ụgbọmmịrị , a kpọrọ 'Suezmax Narmada Spirit' gawa ahịa mba ofesi n'ụbọchị Wenezde. Shell kwuru n'oge gara aga na ha ga-ebido nrụzi ebe ngwupụta mmanụ dị na Bonga iji mee ka ọrụ ha ebe ahụ na-aga dịka ọ kwesịrị. Ọnụ na-ekwuchitere Shell bụ Bamidele Odugbesan,kwuru na akwụkwọ ọzị O depụrụ na ""nrụzị a ga enye aka hụ na anyị gara n'ihu na ngwpụta mmanụ ma wepụ arụkata akwụsi akpaghị akpa.""" afirika-43735889,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43735889,Obiano ga-eme ụlọ agha Ojukwu ebe nkiri,Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano na-akwado ikwanyere dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ugwu n'ụzọ pụrụiche.,"Ojukwu bidoro Biafra n'ọnwa May 1967 O kwuru na ọ ga-eme ụlọ dị n'okpuruala ebe Ojukwu nọ n'oge agha (bekee kpọrọ ya Bunker) nke dị na Amorka n'okpuruọchịchị obodo Ịhiala dị na steeti ahụ ebe ndị mmadụ ga na-abịa njem nkiri. Obiano kwuru na ọ ga-emezi ya bụ ụlọ agha ka ọ dị mma maka njem nkiri. O sị n'ọnụ onyeisi ndị na-ekwuputara ya okwu bụ James Eze, ka e mechara nzụkọ mgbasa ozi kwuo na gọọmentị ya ekwetala ịwepụta ebe nkiri dị icheiche n'Anambara. Ojukwu chiliri aka elu nye gọọmentị etiti na Jenụwarị 1970 ị ji kwụsị ọgụ Biafra. Gọvanọ Obiano kpọpụtara ụfọdụ ebe ndị a dika Ọgba Ogbunike dị n'okpuru ọchịchị Oyi nakwa ọgbaukwu na nsụda mmiri dị n'obodo Owerre Ezukala dị n'okpuru ọchịchị Orumba Saụt. Eze kwukwara na n'ime ụbọchị otu narị Gọvanọ obiano nọgoro n'ọchịchị, ọ ga-eme ihe pụrụiche n'ihe gbasara ebe nkiri ka steeti ya wee nwetacha uru dị na ya. N'ọnụ ya, ""anyị na-agba mbọ ịhụ na anyị webatara uche ndị mbaụwa niile n'ịhe mgbe gboo, ihe okwukwe na omenaala ndị Anambra steeti."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50520292,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50520292,"Flavour, Chidinma, Davido na ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ n'izu a",Ị ma ihe ndị na-ewu ewu ị na-akwado n'ụzọ dị iche iche mere n'izu a?,"Ọtụtụ ihe sitere n'ihe ndị otiegwu mere, ihe wuru n'ogbe ndị egwuregwu nakwa ihe ndị ọzọ, tụrụ ụzụ n'izu a. Ihe 'dị ire' mere n'izu a, ọtụtụ mere ndị mmadụ obi aṅụrị ndị ọzọ mere ndị mmadụ obi mụrịmụrị. Dọrọ oche nọrọ ala ka anyị gbaa gị ụkwụ n'eze: 1) Flavour na Chidinma Akụkọ egwuregwu 'ihunanya' dị n'etiti Flavour na Chidinma fegharịrị n'igwe soshal midịa. Anyị hụrụ na ha abụọ gụkọrọ egwu a kpọrọ Ihunanya ebighiebi '40 years Everlasting', ka ha abụọ setere onyoonyo na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ha na-alụzị onwe ha. 2) Burna Boy Otiegwu a gosipụtara na a họrọla egwu ya maka ihe nrite Grammy. Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy? Nke a wee mee ka ọtụtụ ndị a ma ama na-ebunye ya ụkpa ekele. 3) Padita Agu Ọmarịcha nwaanyị a ị hụrụ ebe a wuru ewu n'izu a maka ama ọ gbara maka ihe ọ gabigara n'alụmdị ya. Ihe o kwuru na-emetụ n'obi. 4) Davido Di Chioma gbara n'anwụ maka egwu ọhụrụ ọ kụpụtara bụ nke pụtara n'ime abalị 21-11-19 bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. 5) Goodluck Jonathan Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan, gbara n'anwụ maka ncheta ọmụmụ ya. 6) Timi Dakolo Dakolo tiputara egwu ọhụrụ maka Ekeresimesi n'ụbọchị Fraịde bụ 22 nke ọnwa Nọvemba 2019. Nke a mere o ji wuo ewu n'izụ a. 7) Jose Mourinho Jose Mourinho malitere ọrụ ọhụrụ ya na Tottenham Hotspur kemgbe ọnwa iri na otu ọ pụrụ na Manchester United. Nke a mere o ji wuo ewu n'izu a. 8) Zubby Michael Izu a na 'Gịnị na-afịọ' nke BBC Igbo, ka Zubby Michael bịara chakee: O nwetakwara ọkwa gọọmentị n'Anambara steeti, ka Gọvanọ Willie Obiano mere ya onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49977808,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49977808,Ihe ịhụnanya Jazz na-ebute,"Olakunle Tejuosho kwụ n'ime ụlọahịa egwu ya, The Jazzhole yiri uwe 'buba' na 'sokoto' na-agwa ndị ọrụ ya okwu.","Olakunle Tejuoso n'ọdọahịa egwu ya na Lagos Ọ malitere ịcheta maka egwuregwu kachasị masị ya mgbe ọ dị n'ụmụaka. ""Na mbụ, e nwere m olileanya na m ga-enwe ọdọahịa egwu...e bidoro m ịdokọ egwu mgbe m bụ nwata. ""Ọ dịrị m mfe ịsoro ụzọ egwuregwu nwata m mgbe m gụchara akwụkwọ"" ka Tejuoso kwuru. The Jazzhole The Jazzhole nke dị n'ụzọ Awolowo na Legọs bụ uzo mepee n'afọ 1991 n'ebe ọzọ n'obodo ahụ. Ugbua, mgbe ụdịrị egwu ""Afrobeat"" na-ewu n'igwe okwu nakwa ebe niile, The Jazzhole na-echekwa ụdịrị egwu ọzọ pụrụiche. Ya mere na ọdọahịa egwu ahụ bụ otu ebe ndị mmadụ na-aga ịcheta nakwa ịgere egwu ochie a ma ama na mbụ. The Jazzhole nwere egwu Jazz si n'oge gboo dị icheiche ""Na mbụ anyị mepere, ebumnuche anyị bụ ịre egwu Jazz na egwu Afrịka ọbụla, ya bụ egwu ndị ojii"" Mgbe ahụ egwu ndị a na-ewu ewu n'afọ ndị 1990, mana ugbua, ụdịrị egwu ndị ọzọ amalitela. ""[Ndị na-azụ m ahịa] bụ ndị ọgaranya, mgbe teknụzụ CD ka dị ọhụrụ. Ọbụghị sọsọ ịzụ, ha ghọtara egwu ahụ n'ihi na ha ahụla ụfọdụ otiegwu ahụ. ""Ha agaala mba ofesi ma nwekwaa ego iji gaa n'ogige egwu ndị a"" Kasetị egwu Jazz dị icheiche Tejuoso kọwara na n'oge a, ndị mmadụ chọrọ ""jazz funk"" nakwa ""smooth jazz"" ""Ndị ntorobia oge a dị iche karịa mgbe anyị na-eto eto"" N'agbanyeghị na anyị na-egere egwu mgbe anyị chọrọ, The Jazzhole ka na-ere kasetị egwu. Egwu a na-agụ ugbua The Jazzhole bụkwa ebe a na-agụ egwu ugbua ugbua. Tejuoso sị na ọ bụ iji wụlite ọnụọgụgụ egwu erere ere ka o ji bido nke a. ""Ị ga-echeta na anyị malitere tupu teknụzụ ịntanetị amalite. Mgbe ahụ ịchọ ịre kasetị egwu ị ga-eji igwe okwu maọbụ ịchọọ ụzọ ọzọ ị ga-esi kpọbata ndị mmadụ n'ime ọdọahịa egwu gị. Ya mere na ị ga-enwe ogige egwu ma ree kasetị na ngwụcha ya iji gbasa ozi maka egwu ahụ."" Ọnọdụ otiegwu Nneka na The Jazzhole n'Ọgọst 2019 The Jazzhole anabatala otiegwu dị icheiche dịka Asa, Brymo nakwa Nneka. Dịka Tejuoso na-echeta ihe ndị mere n'afọ ndị 1990, ọ kpọ nwunye ya so nwere ọdọahịa egwu ahụ ịjụ ya nke ya. ""Maka mụ, ọ ka bụ mgbe [Fatai Rolling] na-ewu. Abịa n'egwu, ọ bụ ụbọchị ochie ndi ahụ"" ka o kwuru. Tejuoso na-echeta mgbe mgbe otu onye so tipute egwu ""highlife"" Fatai Rolling Dollar na otiegwu Keziah Jones na-agụkọ egwu. ""Sọsọ etu egwu onye si n'oge gboo ahụ [1950] na ndị otiegwu 1990 si ejekọ ọnụ. Otiegwu Naịjirịa Fatai Rolling Dollar ebe ọ na-eti egwu na Cargo n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun, 2009 na London. ""Ọ tọrọ m ụtọ pụrụiche nakwa ndị na-egw egwu a, ihe mere ndị egwu ochie na ndị ntorobia ji bịakọta ọnụ."" ""Nke Asa pụrụiche. Ọ pụrụiche n'ihi na ndị mmadụ juputere ebe niile"" ka nwunye kwuru. Egwu kasetị nke Jazzhole Dịka ndị mmadụ jisike achọ egwu ndị Afrịka, Tejuoso ekpiebe na ọ gaghị sọsọ onye orure kama onye nrụpụta egwu. Ya mere na o bidoro ụlọ egwu nke ya n'afọ 1995. ""Na afọ ndị 1990s, ọtụtụ ihe anyị nwere bụ ịbubata egwu Afrịka si mba Yurop maọbụ ebe ọzọ n'Ofesi. ""Etetara m ụra otu ụbọchị kwuo na anyị kwesiri ị na-arụpụta egwu nke anyị. Etu ahụ ka anyị si bido ụlọegwu m"" Egwu ndị Jazzhole Records rụpụtara N'agbanyeghị na egwu Jazz agbanweela dị ka enwere egwu ndị ọzọ, Tejuoso kwenyere na ohere ka dịrị ya n'ahịa egwu Naịjirịa. ""Ọ bụrụ na jazz ga-enwe ọdịnịhu ebe a, anyị ga-eme ya asụsụ anyị. Anyị ga-atụgharị ya n'ime onwe anyị."" Ọtụtụ ndị a ma ama dịka Salif Keita, oti egwu mba Mali, Lupita Nyong'o, Danai Gurira nakwa Eze Mohammed VI nke Morocco. N'ime Jazzhole akwụkwọ, kasetị na CD egwu Jazz nakwa usi kọfị gosiri na ọ bụ ebe ga na-amasị ndị hụrụ jazz n'anya ""Maka mụ, jazz dị mkpa ma ndị mmadụ bịa ị gere ya bụ egwu n'abụghị ịse sịga ma ṅụọ mmanya n'elu egwu ahụ. Ọ bụ ụzọ pụrụiche iji nabata egwu ahụ.""" afirika-49835631,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49835631,Operation Python Dance: Kedụ ebe a ga-agba Egwu Eke nke 2019?,Ndị agha Naijirịa si na ha adila njikere imalite atụmatụ nkwado ọrụ ha kpọrọ Egwu Eke n'Ọwụwa Anyanwụ.,"Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Atụmatụ a ga-eme na mpaghara di iche iche na Naịjirịa mana aha ha dị iche iche. N'Ọwụwa Anyanwụ ha ga-eme Egwu Eke n'Abịa, Anambara, Ebonyi, Enugwu na Imo. N'etiti Ugwu (Benue, Nasarawa, Kogi, Taraba na Kaduna) ha nwere nke ha kpọrọ Ayem Akpatuma. Na Ndịda Naịjirịa na Ọdịda Anyanwụ (Akwa Ibom, Rivas, Cros Riva, Delta, Edo, Legọs na Ogun) ọ bụ nke akpọrọ ""Crocodile Smile"". Ndi agha sị na atụmatụ ndị a bụ iji nye aka maka nchekwa ka ha ji eme ihe a. Ha kwukwara na atụmatụ nke a kpọrọ ""Operation Positive Identification"" bụ nke ha na-eme na mpaghara Ugwu maka ndị oyi egwu bụ Boko Haram na IS ga-emechaha gazuo Naịjirịa niile.. Ihe 'Operation Positive identification' pụtara bụ na mmadụ niile na-eme njem maọbụ ndị bị n'obodo ga-egosi akwụkwọ njirimara tupu ha agafee mgbochi ndị agha tinyere n'okporo ụzọ. Akwụkwọ njirimara a nwere ike ịbụ nke ""National Identity Card"", ""Voters Registration Card"", ""Drivers License"", ""International Passport"" maọbụ ihe ọzọ nwereike igosi onye mmadụ bụ. Ha kwuru na atụmatụ a amịtala mkpụrụ na mpaghara ugwu Ọ bụ ngalaba ndịagha nke 2, 6, 81 na 82 ga ahazi nke a. Ha kwuru na atụmatụ a ga-ebido n'abalị asaa nke Ọktoba ruo abalị iri abụọ na anọ nke Disemba n'ebe dị icheihce. Ndị agha Naijirịa gakwara n'ihu gwa ndị Naijiria nille ha atụla ụjọ ma ha hụ ndị agha, ndị nchekwa ndị ọzọ maọbụ ụgbọala eji alụ agha n'okporo ụzọ. Ha kwukwara na ha ka dị njikere ichekwa Naijiria. Ha kpọrọ nke mpaghara ugwu 'Ayem Akpatuma' Cheta na ọ bu n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2017 ka ndị agha sitere n'ikike ""Egwu Eke"" were wakpo Afaraukwu bụ obodo Nnamdi Kanu nke mere ka ọ gbapụ na Naịjirịa. Ma rụo taa, ndị obodo Afaraukwa ka na-akọ akụkọ mkpamkpa ndị agha kpara n'obodo ha oge ahụ. Akụko ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọka mmụta Boniface Igbenehue" egwuregwu-43110477,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43110477,Kano Pillars: Chinedu Udoji anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ,Otu jikọtara egwuregwu bọolụ na Naịjirịa bụ NFF etiela mkpu n'oke olu banyere ọnwụ nwafọ Naịjirịa na-agbara otu kano Pillars bọọlụ.,"Udoji mụrụ ụmụ abuọ tupu ọnwụ ya Udoji nwụrụ n'ụbọchi ụka n'ihe mberede nke okporoụzọ mgbe osi n'ụlọ ndịna ebe ọ gara leta ndị enyi ya na-agbara otu Enyimba bọọlụ ala. Onye mgbasa ozi ndị Kano Pillars bụ Malikawa Garu kwuru na ụgbọala Udoji sọbara isi n'ihe nkewa etiti okporoụzọ jikọrọ ụzọ Club na Independent dị na Kano. Udoji so gbaa asọmpi nke NPFL dị n'etiti ndị Kano Pillars na Enyimba n'ụbọchị ụka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara otu onye ọka n'akụkọ egwuregwu bụ Ihunnanya Okoye mara Udoji nkeọma, ọ kọwara ya dịka onye mara ihe ọtagbutara n'egwuregwu bọọlụ. O kwuru na Udoji nwere umeala na obioma, ebe o tikwara ezinaụlọ ya aka n'obi. Gee ihe o kwuru: NFF ebela akwa maka ọnwụ Udoji Ihe ịkwesiri ị ma gbasara Chinedu Udoji Ozi nkasị obi Ọtụtụ ndị mmadụ na otu dịka NFF, Kano Pillars, Enugu Rangers, Rivers United na ndị ọzọ hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya ezigarala ezinaụlọ ya ozi nkasị obi:" afirika-50192171,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50192171,"Nekede Students' Protest: Ndị EFCC, SARS na-emekpa anyị ahụ","Ụmụakwụkwọ nke ụlọakwụkwọ Politekiniki dị na Nekede, n'Imo steeti, na-ewe iwe maka oke mmekpa ahụ nke ha sị na ndị ọrụ nchekwa na-emekpa ha.","Iwe ha gbajuru n'ọnụ n'ụbọchị Fraịdee nke mere ka ha were okwute chụọ ndị ọrụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na ụlọakwụkwọ ahụ. Otu nwata akwụkwọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị SARS bịara ịkpụrụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ. SARS bụ ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' na Bekee. #EndSars: Ekwesiri imechi Sars kpatakpata Nwaakwụkwọ a kwuru na ugboro ugboro ka ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-abịa eyi ụmụakwụkwọ egwu. O kwuru sị: ""Abalị abụọ gara aga, ọ bụ ndị EFCC bịara kpụrụ ụmụakwụkwọ karịrị iri ise."" ""Ụnyaahụ bụ ndị SARS. Ha anaghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko."" EFCC bụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka nke pụtara 'Economic and Financial Crimes Commission' na bekee. Gịnị na-ese? Ugboro ugboro ka ndị EFCC kwuru na ha anwụchiela ụmụokorobịa ji kọmputa egwu wayo Dịka nwaakwụkwọ ahụ si kwuo, ndị ọrụ nchekwa na-ebo ụmụakwụkwọ ebubo na ha bụ ndị ohi maọbụ ndị ji igwe kọmputa aghọgbu ndị mmadụ nke bekee kpọrọ 'internet fraudsters'. Mana ọ kọwara na mwakpo a akarịala nke na ha agaghịzi edinwu ya. ""Mgbe ụfọdụ, mmadụ ga-anọ n'ime ụlọ ya, ndị EFCC maọbụ SARS etiwaa ụzọ, kpụrụ onye ukwu na onye nta,"" ""Ha hụ na i nwere kọmputa maọbụ 'I-Phone', ha ebo gi na ị bụ onye 'yahoo yahoo', kpụrụ gị."" ""Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-eji ego buru ibu agbapụta onwe ha ma a kpụrụ ha."" Ndị mmadụ na-ebokwa ndị SARS ebubo iwakpo ụmụokorobịa aka ha dị ọcha. ""Iwe anyị bụ na ndịisi ụlọakwụkwọ anyị anaghị eme ihe ọbụla iji kwụsị ụdị mmekpa ahụ a."" Nwata akwụkwọ a anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-ele ule ugbua. Nke pụtara na ọtụtụ ndị SARS kpụụrụ ụnyaahụ agaghịzi eso lee ule. Ihe ndị nchekwa kwuru Ibrahim Magu bụ onyeisi ndị EFCC Chris Oluka bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi na ụlọọrụ EFCC dị n'Enugu. Ọ bụ ụlọọrụ a na-elekọta ụlọọrụ EFCC niile dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ọ kọwara na ọbụ ọrụ iwu nyere ha ka ha na-arụ dịka ndị na-egbochi nrụrụaka. O kwuru na ""ihe gbasara mpụ ịntanetị ka njọ n'etiti ndị ntorobịa nọ n'ụlọakwụkwọ nakwa ndị ka guchara ọhụrụ."" Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị uweojii Mana Oluka kwuru na ha na-ajụ ese nke ọma tupu ha agaa ịkpụrụ mmadụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ pụtaghị na ikpe mara onye ọbụla ha kpụụrụ. ""Anyị na-enyocha nke ọma ma tọhapụ ndị aka ha dị ọcha. N'otu aka ahụ kwa, Orlando Ikeoku, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo State sị na ya anụbeghị maka ngagharịiwe ụmụakwụkwọ Nekede mere na Fraịde. O kwuru na ọ ga-ezighachiri anyị ozi ma ya nweta ya bụ akụkọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'" afirika-49218665,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49218665,Ebelechukwu Obiano: Ugegbe anya na-ese okwu,Nwụnye aka na-chị Anambara Steetị bụ Odozi Akụ Ebelechukwu Obiano na-ewu na soshal midia Naịjirịa maka enyo anya oyi gaa akwamozu n'Ihiala.,"Ọ bụghị sọsọ Odozi akụ Obiano gara ya bụ akwamozu, mana ọ bụ ya pụrụiche maka kpọcha kpọcha enyo anya ya. Akwamozu ahụ bụ nke Ichie Michael Chukwuka Onyema, bụ nna onye nwe ụlọ ọrụ ugboelu Air Peace bụ Maazị Allen Onyema emere ụbọchị Fraịde nke mbụ n'ọnwa Ọgọst 2019. Ọbụghị sọsọ Odozi akụ Obiano na di ya bụ ndị ama ama gara ya bụ akwamozu, mana ọ bụ ya ka anya hụrụ ọfụma, maka kpọcha kpọcha enyo anya ha. End of Twitter post, 1 Agbenyeghi na onwere ụfọdụ na-eti mkpu maka ego ole ha na-eche na a na-ere ya bụ ugegbe, onwekwara ndị na-aja ya na ọ maka n'ihu nwụnye Governor Obiano. BBC Igo nyochara ya bu enyo anya were chọpụta na ọ bụ ọpụrụiche ụlọ ọrụ Gucci - bụ ndị enyo mepụtara oyiri enyo anya ahụ - mere sọsọ 100. Nke a pụtara ya bụrụ na ọ bu n'aka Gucci ka nwanyi mbụ n'Anambara gotere enyo anya ya, ọ nwereike iso n'ime 100 ahụ ha mepụtara n'usoro Bekee kpọrọ ""Limited Edition Mask sunglasses with crystals"". Usoro mmepụta nke adịghị emepụta ọtụtụ bụ ihe Bekee kpọrọ ""Limited Edition"". Mana lezia mgbe ọzọ Ebelechukwu Obiano kpịara enyo anya ọpụrịche: Ebele Obiano dịka onye ugegbe anya na-amasị. Ebe a ọ nọ mba ofesi jir ya kwado uwe ndị ọcha Ọ na adị jiri ya ahazị ejiji ya ma ọ na-apụta n'ọha. Ebe a, o ji ya kwado ikike ndị chiri echichi Ka a na-atụ ụmụ ada Anamabra ugo, Ebelechukwu Obiano dịka ka ọ na-adị N'ụka, Ebelechukwu Obiano na di ya ji ugegbe anya oji chọọ ihu mma Ka ọ na-anata asambodo, ugbegbe anya ya na uwe ya gbakọrọ nọ ka ha adị otu Ugegbe anya na-amasịkwu Gọvanọ Obiano Akụkọ ga-amasị gị" 44861729,https://www.bbc.com/igbo/44861729,Katsina: Uzọ ise ị ga-esi gbalahụ oke idemmiri,"Ihe karịrị mmadụ iri anọ (44) nwụrụ, ebe ụlọ narị ise (500) bụ ihe dakpọrọ n'ihi oke idemmiri wakporo Katsina steeti.","Oke ọdachi ahụ mere n'ụbọchị Monde bulitere mkpa ọ dị ndị Naịjirịa ichekwa onwe ha iji gbalụ ụdị ọdachi a. Dịka ọkammụta n'ihe gbasara igwe nke a na-akpọ ('Geographic Information System' -GIS) na bekee nke ụlọọrụ National Expert na bekee nke siri kọwa, bụ Anthony Okenwa ide bụ ọdachi si na chi na-eme ma oke mmiri ọzụzụ zoo n'obere oge maọbụ na mmiri tofee oke osimiri. ""Oke mmiri ọzụzụ na nwa oge nwere ike ibute oke ide mmiri. Mmiri si oke osimmiri tofee nwekwara ike ibute oke idemmiri."" Dịka Okenwa siri kọwa, ihe na-ebute ihe ndị a bụ mgbanwe igwe nke a kpọrọ 'climate change' na bekee na oke owuwu ụlọ n'ihi mmepe obodo. Lee azụ ise Okenwa tụpenyere gị banyere ka ị ga-esi chekwa onwe gị na ezinaụlọ gi n'ebe oke ide dị: 1. I mee ka ọwa mmiri basaa 'Ịkpọchapụ aja maọbụ ahịhịa n'ọwa mmiri ka idemmiri were hụ ụzọ e sị aga nakwa ịwasa ọwa mmiri ka ọ bụkwa ibu.' 2 Ikunye osisi Osisi bụ ihe mgbochi nye idemmiri. Ịkụ osisi na-enye aka n'igbochi idemmiri. 3. Kwapụ ma i biri n'ọwa mmiri ide Oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri anọ na Katsina ""Mmiri ide nwere ebe o si ehute nwekwa ebe ọ na-ehuga. Ọ bụrụ na ibi na ndagwurugwu ebe mmiri ide na-adọ ma oke mmiri zọọ, kwapụ."" 4. Lebanye n'ihe gbasara ọwa mmiri ma ị na-azụ maọbụ na-arụ ụlọ Oke iwu ụlọ na ihe ewumewu ndị ọzọ n'eleghi anya n'azụ so n'ihe na ebute nsogbu oke idemmiri. Ị chọrọ ịrụ ụlọ, gbaa mbọ hụ n'ụlọ gị anọchịghị ọwa mmiri. Nyekwa ohere maka ọwa mmiri ga-esi na-aga. 5. Gọọmenti ịhazi atụmatụ ị mara ndị mmadụ ọkwa ịdemmiri na-abịa. Agha a kara aka anaghị eri ngwụrọ. Dịka Okenwa siri kọwa, ""ọ dị mkpa na gọọmenti nwere ụlọọrụ na-agwa ndị mmadụ oke a ga-enwe oke idemmiri ka ha weere kee nkwucha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49666499,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49666499,Rochas Okorocha: APC agbakụtala m azụ,Rochas Okorocha akwaala arịrị maka ihe ọ na-agabiga n'otu APC na agbanyeghị nkwado niile o nyerela pati ahụ.,"Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Okorocha gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzde n'Abuja na APC na onyeisioche ha bụ Adams Oshiomhole ""agbakọtala ya azụ."" na agbanyeghị mbọ ọ gbara ịkwalite pati ahụ n'Imo nakwa ọwụwa anyanwụ. ""A gbara m mbọ ịhụ na Oshiomhole batara n'ọkwa onyeisioche patị anyị, ọ (Oshiomhole) ma nke ahụ"" O kwukwara mwute ya maka etu ihe sị aga na APC ugbua. Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo ""Amaghị m ebe m kwụ akwụ gbasara ọrụ akwụsịrị m n'ike n'ihi o nweghi onye na-agwa m ihe na-aga na APC kemgbe"" Ihe ọzọ Okorocha kwuru bụ na ọ lụrụ ọgụ niile APC nwere n'ọwụwa anyanwụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ. ""Ihe a bụ ihe na-ewute m nke ukwu n'ihi na eche m na anyị niile bụ otu ezinaụlọ na-agba mbọ maka ọganihu ala Naịjirịa"" ka o kọwara. Maka ọdịnihu ya, o kwuru na ọ ka na-eche ihe ọ ga-eme n'ihu ma kwuo na etu ihe si aga, na ọ dị ya ka APC a ga-anwụ ma Onyeisiala Buhari rituo n'ọkwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị" egwuregwu-44619600,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44619600,World Cup 2018: Ajentina ejirila 2 - 1 gbapụ Naịjirịa,Naịjiria na Aịsland adapụla ka Ajentina meriri ha ma gafee agba mgbapụ.,"Daalụ maka isonye anyị n'abalị a, sonyekwa anyị ọzọ echi. Mmeri ajentina meriri Naịjirịa pụtara na ha ga-ezute Frans n'agba mgbapụ (round of 16). Cheta na nke a mere ya ugboro ise Naịjirịa na Ajentina na-ezute n'egwuregwu bọọlụ. Nkeji 90 na ụma: Ogbu bọọlụ enyela Messi akwụkwọ edo edo. Nkeji 90 na ụma: Naịjirịa ewepụla Musa tinye Simy Nwankwo. Nkeji 90 na ụma: Ogbu bọọlụ enyela Mikel Obi akwụkwọ edo edo. Nkeji 90: Naịjirịa ewepụla Omeruo tinye Iwobi. Nkeji 87: GOOOLUUUU!!! Rojo agbakaala neetị ka Mercado bunyere ya bọọlụ. Nkeji 83: Ighalo butere bọọlụ mana Armani tinyere ahụ ya, bọọlụ ebie ya n'ahụ. Nkeji 81: Rojo agbaala bọọlụ n'ihu poostu Naịjirịa mana Higuain butere ya gbafuru ya. Nkeji 80: Ajentina ewepụla Tagliafico tinye Aguero. Nkeji 78: Aịsland asaala goolu ndị Kroeshia nyere ha, nke pụtara na enwebeghị onye isi ya pụtara n'etiti Naịjirịa, Aịsland na Ajentina ugbua. Nkeji 76: Ndị Naịjirịa etiela mkpu maka penariti. Ogbu bọọlụ gara lee VAR, mana o kweghị enye ha penariti. Oparanozie: Anyị na-ekpere Super Eagles ekpere Nkeji 72: Ajentina ewepụla Di Maria tinye Meza. Nkeji 70: SHỌỌTỤ!!! Ndidi gbara shọọtụ dị egwu mana bọọlụ gafere n'elu neetị Ajentina. Nkeji 67: Mascherano emerụọla ahụ n'ihu, mana ọ chọghị ịpụ ga hichapụ ọbara na-apụta. Nkeji 64: Ogbu bọọlụ enyela Banega akwụkwọ edo edo. Nkeji 62: Ajentina nwetara 'corner kick' ka Ekong gbapụrụ nso neetị, mana ha ejinwughị ya nye goolu. Nkeji 61: Ajentina ewepụla Perez tinye Pavon. Nkeji 59: Musa ebutela bọọlụ, gbada n'aka ekpe, kpapụ Mascherano n'ụzọ mana bọolụ o bunyere Ighalo abanyeghị. Nkeji 55: Ndị na-akwado Ajentina etishiela mkpụ ike maka goolu Naịjirịa nyere. Ha ma na nkwado ha ga-enyere ndị ọgba bọọlụ ha aka ma ọ bụrụ na ha ga-emeri taa. Nkeji 50: GOOOOOLLLLUUU! Moses enyela penariti ya. Nkeji 49: Ogbu bọọlụ enyela Naịjirịa penariti ka o lechara VAR. Mascherano nwetara akwụkwọ edo edo maka ihe o mere Balogun. Nkeji 47: Naịjirịa ewepụla Iheanacho tinye Ighalo. Nkeji 45: E bidola ọkara nke abụọ. Goolu Messi nyere na nkeji 14 mere ya nke mbụ ọ na-enye kamgbe e bidoro asọmpi a. Ndị Ajentina chara Naịjirịa ezigbo ọkụ n'ime ọkara nke mbụ nke egwuregwu a, nke mere na obi amapụla ndị na-akwado Naịjirịa maka amaghị ma isi Naịjirịa a ga-apụtakwa taa. Cheta na ọbụrụ na Naịjirịa na Ajentina gbaa onye laba onye laba, ndị Ajentina ga-apụ n'asọmpi a. N'otu aka ahụ, ọbụrụ na Aịsland merie Kroeshia n'egwuregwu nke ha, Ajentina ga-alatụkwa. Mana ọbụrụ na Ajentina merie Naịjirịa, ha ga-agafe agba mgbapụ, ga-eme ka Naịjirịa pụọ n'asọmpi a. World Cup: Naịjirịa ga-emeri Ajentina Ndị nọ n'oche Ajentina: Nahuel Guzman, Willy Caballero, Giovani Lo Celso, Maximiliano Meza, Paulo Dybala, Lucas Biglia, Eduardo Salvio, Cristian Pavon, Federico Fazio, Marcos Acuna, Sergio Aguero, Cristian Ansaldi. Ndị nọ n'oche Naịjirịa: Ikechukwu Ezenwa, Daniel Akpeyi, Alex Iwobi, Simy, Odion Ighalo, Tyronne Ebuehi, Abdullahi Shehu, Chidozie Awaziem, John Ogu, Elderson Echiejile, Joel Obi, Ogenyi Onazi. Ndị Ajentina ji bido bọọlụ: Franco Armani; Gabriel Mercado, Nicolas Otamendi, Marcos Rojo, Nicolas Tagliafico; Javier Mascherano, Ever Banega; Enzo Perez, Lionel Messi, Angel Di Maria; Gonzalo Higuain. Ndị Naịjirịa ji bido bọọlụ: Francis Uzoho; Leon Balogun, Kenneth Omeruo, William Troost-Ekong; Victor Moses, Wilfred Ndidi, John Obi Mikel, Oghenekaro Etebo, Brian Idowu; Kelechi Iheanacho, Ahmed Musa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-45041771,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45041771,Ego Ronaldo kachasị nke ụfọdụ ndị bọọlụ a ma ama,Ị ma na oti egwu bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na-anata ego karịrị a gbakọta ego a na-akwụ ndị egwu bọọlụ anọ ama ama?,"NKe a so n'ihe nwa amadị a banyere otu egwuregwu Juventus ọhụrụ ji ewu na soshal midia ugbua. Ego Ronaldo karịrị ugboro anọ ego Higuain, Dybala, Donnarumma na Souza na-anata ugbua, dịka Team FA siri kwupụta na Twitter. Cristiano Ronaldo dos Santos Aveiro bụ onye ama ama dịka ọgba bọọlụ nke ala Portugal na Juventus. Nwa amadị a a mụrụ n'ụbọchị 5 n'afọ 1985 na-eri €30m dịka ụgwọ ọnwa n'afọ. Ronaldo bụ onye ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ a kpọrọ Federation of International Football Association (FIFA) turu ugo ruo ugboro ise dịka onye kachasị agba bọọlụ n'uwa niile ugboro ise. Gonzalo Gerardo Higuaín bụ onye ọgba bọọlụ Ajentina na Juventus a muru n'ụbọchị 10 n'ime ọnwa December n'afọ 1987 na-ana €8.5m n'afọ. Paulo Bruno Exequiel Dybala bụkwa onye ọgbabọọlụ ala Argentine na Juventus na-eri €7m n'afọ. A mụrụ nwata nwoke a n'ụbọchị 15 n'ime onwa November n'afọ 1993 Gianluigi Donnarumma bụ ọgba bọọlụ ha mụrụ n'ụbọchị 25, ọnwa Febuwarị, afọ 1999 na-anata €6m. Ọ bụ onye otu Serie A na kwa bụrụ onye otu mba Italy. Douglas Costa de Souza bụ onye ala Brazil na-eri €6m. A mụrụ nwa amadị a n'ụbọchị 14 n'ịme ọnwa September, afọ 1990. Lee ka Team FA sị depụtara na Twitter na-ebute nnukwu ndọrịtaụka na Twitter ugbua. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43962378,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962378,"Lee ndị uweojii aka ha kacha kwụrụ ọtọ na Naịjirịa, otu bụ onye Igbo","Ị gaa n'ọtụtụ ụlọọrụ ndị uweojii ị ga-ahụ ka e dere 'ndị uweojii bụ enyi gị', mana ọ rara ahụ ịhụ onye Naịjirịa nwere ntụkwasị obi n'elu ndị uweojii.","Mazị Ken Nwosu na Adekunle Rufus Adedeji anaghị ana aka azụ ka ha na-arụ ọrụ ha N'afọ 2017, otu ndị International Police Association na otu Institute for Economics and Peace kwuru na otu ndị uweojii Naịjirịa bụ nke 'kachasị njọ' n'ọrụ uweojii mbaụwa niile. Nkwuputa a so mee ka ọtụtụ ndị Naịjirịa kwudosịa ike n'okwukwe ha na ndị uweojii Naịjirịa anaghị arụ ọrụ nchekwa edinyere ha. Mana ndị uweojii abụọ na-agbanwe ebumnuche ndị mmadụ banyere ndị uweojii na Naịjirịa. Maazị Ken Nwosu na Adekunle Rufus Adedeji nwetara ihe nrite maka ịbụ 'ndị uweojii aka ha kachasị kwụrụ ọtọ' na Naịjirịa. Ndị otu na-ahụ maka oke ruru onye bụ Constitutional Rights Awareness and Liberty Initiative (CRALI) na ndị US Consulate dị na Naịjirịa jikọtara aka ọnụ wee nye ha ihe nrite a. Dịka ndị CRALI si kwuo, ha chọrọ ma jụọ ndị mmadụ maka ndị uweojii aka ha kwụ ọtọ na Naịjirịa niile wee họpụta mmadụ ruru 22, ebe ha si họpụta Adedeji na Nwosu dịka ndị kachasị mma. Adedeji bụ Superintendent na-ahụ maka otu Criminal Investigative Bureau nke Ekiti Steeti ebe Nwosu bụ Divisional Police Officer ọhụrụ nke ndị Kwani divisional headquarters dị na Sokoto Steeti. Ken Nwosu arụọla n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja nakwa Lagos na Akwa Ibom Adedeji gwara BBC na onwere etu o si eme ya n'ahụ ma ndị Naịjirịa na-ekwu okwu ọjọọ maka ndị uweojii, maka na ọ bụghị ha niile na-eme ihe ọjọọ. O kwuru ""Ọ bụ eziokwu na enwere ndị uweojii ọjọọ, mana etu ụfọdụ si akpa agwa bụ maka etu e si zụọ ha n'ụlọ. Ọ bụ ihe na-eme n'obodo na-egosi n'etiti ndị uweojii."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44559060,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44559060,Bọjetị 2018: Ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu maka ebubo onyeisiala,Mana ụmụ Naịjirịa na-etinyekwa ọnụ ha na ya bụ okwu n'igwe mgbasaozi twitter ebe ha na-egosi etu o si emetuta ha ma na-ewe ha iwe.,"Kamgbe ọnwa Nọvemba ka Buhari nyere ndị omeiwu bọjeti ka ha lebaa anya Onyeisiala binyere aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu Naịjirịa nke afọ 2018 ụnyaahụ ebe ọ kpoputara ndị omeiwu ụkwụ n'ama na-ebo ha na ha wepụrụ ego ọrụ ya. Ọ gara n'igwe twitter depụta ihe niile e wepụrụ mana ụmụ Naịjirịa ji agwa a gwara ọgwa anabata ya bụ ihe o kwuru. Ebe ụfọdụ kelere ya na-ekwu na ha ahụla na ndị omeiwu bụ ndị iro ọchịchị onye kwuo uche ya, ndị ọzọ na-ajụ ihe kpatara o jiri binye aka n'akwụkwọ ahụ ebe ọ bụ na ọ mara na o nwere nsogbu. Oluyemi Fasipe kwupụtara nke a na twitter ya; Adebayo Bankole Akintunde na-ajụ ihe kpatara na ndị a-akatọ ọchịchị Buhari anaghị ekwu okwu gbasara nkatọ e mere na bọjetị ahụ. Ikechukwu n'akụkụ nke ya kwuru ka a kụọrọ onyeisiala aka na o binyere aka na bọjeti n'ọnwa Juun. Mustafa Ramalan kwuru na ọ dịka ndị omeiwu chọrọ ịrapụta onyeisiala site n'iwetu ego dị na bọjeti mana onyeisial wụrụ ha n'ala site n'okwu ya oge o binyere aka na ya bụ bọjeti Mana Stanley Nwabia tinyere ọnụ n'okwu a were kwuo na ọ bụ awụwọ ka Buharị na-awọgbụ ndị South East maka etu o si na-atụ aka na mbepụ emere na ego akwa Naịja nke abụọ na ọdọ ụgbọelu n'Enugwu. Mana Oluwole Dada na ata ndị omeiwu ụta maka ego ndị a akpara aka. Christian Chukwu kwenyere n'ihe Dada kwuru, ma si na o bu ịgbagwoju ndị mmadu anya ka onyeisiala chọro ime. Onye ọzọ akara ya bụ @Mr_JAGs na-ajụ ma Buhari ọ gụrụ akwụkwọ Bọjeti a maọbụ mmadụ gụrụ ya gwa ya. @SimplyTEEWHY sị na nchọpụta ya na-egosi na onyeisisala amaghị etu ọrụ ọdọ ụgbọelu Enugwu rur tupu ozipụ Bọjeti a. Ndị ụlọomeiwu kwuru na ha ga-ekwu ihe mere ha jiri mee ihe ha mere na bọjeti mana ugbua, ụmụ Naịjirịa ka nọ n'etiti na-ajụ onye eziokwu dị n'ọnụ, Onyeisiala ka ọ bụ ndị Omeiwu. Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị:" afirika-45154125,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45154125,Ohaneze: Aka anyị dị ọcha n'ebe Ipob nọ,Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo ekwuola na aka Ohanaeze adịghị na mmachi gọọmenti etiti machiri Ipob.,"Nnia Nwodo chọrọ nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara nke a kpọrọ 'Restructuring na bekee Nwodo kwuru nke a dịka otu Ipob gụpụrụ onwe ha na mkparịtaụka ikpe udo n'etiti otu abụọ ahụ. O kwuru na ihe Ohaneze mere bụ iti mkpu tigara onye ọkaiwu kachasị n'ala Naịjirịa (attorney-general) megide imachi Ipob, ndị enweghị egbe ha bu ha ji achọ ihe ha na-achọ, ebe ndị Miyetti Allah bụ otu jịkọtara ndị ọchiehi ogbu ọchụ na agagharị n'enweghị mmachi ọbụla. O kwuru na ha kpọkwara oku ka enyocha ma kpụpụ ụlọikpe ndị agha sonyere n'egwu eke emere n'afọ 2017. Ọ gara n'ihu kwuo na ihe Ipob na-achọ bụ referandum na ihe Ohaneze na-achọ bụ 'restructuring bụkwa maka nnwereonwe, nke agaghị akwafu ọbara. Ihe ndị a niile dị n'ozi nke onye enyemaka mgbasaozi Nwodo bụ Emeka Attah binyere aka. Cheta n'ụbọchị Tọọsde, Ipob gbara abụbụ na nkata udo ha na Ohaneze nwere ,sị na ha chọrọ referandum ebe Ohaneze na ndị gọvanọ ala Igbo chọrọ ka ha nweta osote onyeisiala n'aka PDP na ntuliaka nke 2019. Akụkọ ga-amasị gị :" afirika-56454317,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56454317,Igbo Customs and tradition: Ihe ndị Igbo kwenyere ga-eme ma mmadụ zute anụmanụ ndị a,Obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere nkwenye ha kwenyere gbasara ụfọdụ ụmụ anụmanụ.,"Ọtụtụ nkwenye ndi a bụ ihe a na-akpọ Ụchi nke bekee na-akpọ ""Premonition"" ebe nke ọzo bụ Nkwenyeasi nke Bekee na-akpọ ""superstitious beliefs"". BBC Igbo na Mazi Chigozie Nnabuihe nwere mkparịta ụka ebe ọ kọwaara anyị ụfọdụ nkwenye ndị a. Mazi Nnabuihe bụ onye nkuzi ma bụru kwa ọkammụta n'ihe gbasara asụsu Igbo na Omenala Igbo na Mahadum nke Legọs. Lee ihe ndị ọ rụtụrụ aka na mkaparịta ụka ahụ: Udele: Mazị Nnabuihe kọwara na ọtụtụ mba n'ala Igbo nwere nkwenye na onye njem Udele nyụsara nsi n'ahụ, na ihe ọma chere onye ahụ n'ihu. O kọwara sị, "" Igbo kwenyekwara na mgbe udele besara n'elu ụlọ mmadụ na ọdachi ọkachasi ọnwu nwereike ime n'ụlọ onye ahụ"". Kwaafọkwaọnwụ maọbụ Ajikwụ, nnụnụ obe fịọfịọ. Nnabuihe kwuru maka edemde ode akwụkwọ Wiliam Shakespear dere ebe ọ kwuru maka nnụnụ ọ kpọrọ ""Bird of the Night"" ebe ndị ọzọ na-akpọ ya ""Ill-Ominous-Bird"". Ọ kọwara na ihe edemde ejije Shakespear dere kwuru na ya bụ nnụnụ na-ekwu na ọdachi ga-eme. Kama Igbo nwere aha dị iche iche a na-akpọ ya bụ nnụnụ. O kwuru sị, ""Ube nnụnụ a na-atụ ụjọ na ntị ma ndị igbo kwenyere na mgbe ọbụla ọ bere nna okenye maọbụ dimkpa ga-anwụ n'akụkụ ụlọ ahụ ọ bere "". Obu nke bụ ""sparrow"" n'asụsụ Bekee Mazi Nnabuihe kwukwara si ""Ụfọdụ ndị n'ala Igb kwenyere na mgbe mmadụ na-eme njem, nnụnu a bee n'aka nrị na ihe ọma chere onye ahụ kama ọ bee n'aka ekpe ya, ọdachi chere onye ahụ"". Ijere maobu Erughieru Ijere nke bekee na-akpọ Soldier Ant nwekwara nkwenye ndị igbo kwenyere maka ya. Nnabuihe kwuru si, "" mgbe Ijere kpụrụ n'ite ofe mmadụ nke mere na agaghị eri nrị ahụ ọzọ, ọ bụ uchi ndi Igbo kwnyere na ajọ ihe na-akwado ime"". O kwukwara si na mgbe ijere a metutara ozu mmadụ, na ndị Igbo kwenyere na onye ahụ gwọrọ nsii oge ọ di ndụ. Aṅụ Nnabuihe kwuru si, ""Ụfọdụ ebe n'ala Igbo nwere na mgbe aṅụ kpụrụ n'ụlommadụ n'ehihe na ọ pụtara na onye ahụ ga-enwe ndị ọbịa"". O kwukwara na ụfọdụ nwere nkwenyeasị na mgbe anụ febatara ma fepụwak n'ụlo mmadụ na onye ahụ ga-enwe onye ọbịa. Agwọ Onye ọbụla gburu eke n'obodo a na-asọ ya na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ (Eke; ụfọdu ndi anaghi egbu ya n'ala Igbo) Mazi Nnabuihe kọwara na-enweghị ihe o pụtara ma mmadụ zute agwọ. O kwuru sị "" N'ụfọdụ ebe n'ala Igbo, mgbe agwọ bịara nogide nwa enyiwere n'ala, ha na aṅụrị na onye na-elekọta nwa abịala"". O kwukwara si, enwere nkwenyeasị nke igbo kwenyere na ekwesịghị ikpọ agwọ aha ya n'abali. O kwuru sị, "" Onye kpọro agwọ aha ya n'abali ga-ahụta agwọ kama ka onye ahu kpọọ ya eriri"". Kedụ ihe ndị Sayensi chere maka uchi na nkwenyeasi ndị a? (Dokinta na-enyocha anumanụ) Dokịta na-ahụ maka ahuike ụmụ anụmanụ bụ Ugwu Obinna kọwara na Sayensi akwadoghi nkwnyeasi n'ihi na ha kwenyere na ihe nani na ihe enwereike inyocha maọbụ hazie na laabụ nke ga-enwe mpụtara ka ha na-akwado. O kwuru sị, "" Ọ bụ ndị obodo kwenyere na nkwenyasị ndi a"". Ugwu mara atu sị, "" O bụru na nkita na-aga ebe ọ na amaghị, ọ ga-anyụsa mammiri n'ụzọ nke nwere 'pheromone' . O bu ya ka nkịta ga-ejii mata ụzo lọghachi. Nke a bụ mpụtara nke ndị sayensi ji nyocha were hu na o bu eziokwu""." afirika-56584367,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56584367,"'Ọ bụ ""Feminism"" na-ebute ihe di ji eti nwaanyị ihe n'ụlọ' - Pete Edochie","Ochiedike n'ọrụ ejije bụ Pete Edochie ekwuola hoo haa na ""Feminism"" abụghị omenala Igbo.","O kwukwara na ọ bụ ya bụ nkwenye ọgbara ọhụrụ na-ebute ọtụtụ nsogbu n'ezinaụlọ ugbua. Ọ metụkwara ọnụ n'okwụ gbasara nwoke isekpu ala rịọ nwaanyị ka ọ lụọ ya, bụ nke ọ sị na ọ dabaghị n'omenala Igbo. Kirie ya n'uju ebe a. Ọkwa dị mkpa: Ọ bụrụ na di gị maọbụ nwunye gị maọbụ onye ọbụla n'ezinaụlọ na-akpagbu gị,tie mkpu enyemaka site na ịkpọ ekwentị ndị a: 08000333333; *6820# n'akara ekwentị MTN maọbụ Airtel gị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ọk" media-51500393,https://www.bbc.com/igbo/media-51500393,'Ndị agha Naijirịa wakporo ụfọdụ obodo na Borno steeti' - Amnesty International,Ndị ụlọọrụ Amnesty International si na nchọpụta ha gosiri na ọ bụ ndị agha Naịjirịa gbara ọtụtụ obodo ọkụ na Borno steeti.,"Otu a na-akọwa kwa na ọ bụ kamgbe mwakpo ndị otu Boko Haram kawanyere njọ ka ndị agha Naijirịa bidoro ime otu a. Onyeisi otu a na Naijirịa bụ Osai Ojigho kwuru sị "" ka enyocha ndị agha Naijirịa maka ha ịda iwu na-achikwa ịlụ agha"". Ha kwuru na ihe onyonyo satilịtị gosiri ha na obodo Bukarti, Ngariri na Matiri sọ na obodo ndị agha Naijirịa gbara ọkụ. Ha na-akọwa na ndị agha na-ebu ụzọ kpọrọ ndị obodo ndị a, kpọga ha n'ogige nchekwa tupu ha agbaa obodo ha ọkụ. Enwebeghị ihe ndị agha Naijirịa kwuru maka ebubo a ndị otu a boro ha. Otu Tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma gbaa onye na-akwọ ya ọkụ marụọ osote ya ahụ n'ụzọ Ogbaku dị n'Owere Imo Steeti n'ụbọchị Tọzde. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando sị na ụgbọala a sọbara isi n'etiti blọk e ji kewa ụzọ. Nke a mere ọdọmmanụ ụgbọala ahụ jiri daa n'ala ma nwuru ọkụ gbagbuo onye na-akwọ ya. Orlando gara n'ihu kwuo na ọkụ a metụtakwara otu ụgbọala ọzọ mana onweghi onye merụrụ ahụ n'ime ya. Anya niile dị n'Ụmụahịa taa Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Obi mgbal elu ji ọtụtụ ndị bi n'Umuahia ugbua dịka a ga-eli Eze na Lọlọ Isreal Kanu bụ nne na nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu. Ndị uweojii kwuru na ha achọghị ịhụ ihe njirimara Ipob ebe ahụ mana Ipob sị na ha ga-awụchi ebe ahụ n'uju. N'ofesi Ndị ahuike na Chaịna Ndị na-anata ọgwụgwọ ịba Covid-19 Mba Chaịna ekwuola na mmadu otu puku, nari asaa na iri na isii bụ ndị ọrụ na-eleta ndị bu ọrịa Coronavirus a kpọrọ Covid-19 eburula ya bụ ọrịa, ebe madụ isii n'ime ha bụ ndị ya bụ ọrịa dulara mmụọ. Dịka ọ dị ugbua, mmadụ puku iri isii na anọ na narị itoolu iri abụo na abụo (64,988) bu ya bụ ọrịa, ebe mmadụ puku asaa, otu nari na iri isii na isii (7,166) sị n'ọrịa a pụta. Ulọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation ekwuola na coronavirus anaghị amụbawanye na mba ndị ọzọ na-abụghị na Chaina. Ha sị na ebe ọrịa a kachasị akpa ike bụ na mpaghara Hubei nke Chaịna. N'egwuregwu Pep Guardiola bụ onye bubu onye nchịkọta otu Bayern Munich Onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na e nwereike ịchụ ya n'ọrụ maọbụrụ na Real Madrid gbapụ ha n'asọmpi Champions League. Otu egwu abụọ ndị a ga-adọbiri ya n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Febụwarị a. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ama m na chim ga-enye m di nke m - Nwaanyị lụru di na nka" egwuregwu-44213808,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44213808,Ndị ọgbaa bọọlụ na Yurop na-enyeghi goolu ọbụla n'afọ a,Egwuregwu bọọlụ nke afọ a akwakọrọla ọnụ na mba Yurop mana enwere ụfọdụ ndị ama ama na-enyetaghị goolu ọbụla n'otu ha dị icheiche.,"Yaya bụ nwafọ Ivory Coast mabuterela ihe nrite ọkacha agba n'Afrịka Ndị nke na-agba bọọlụ n'Ịngland gụnyere Yaya Toure nke Manchester City, Michael Carrick nke Manchester United, Yohan Cabaye nke Crystal Palace. Na Spen ha bụ Andres Gomes nke Barcelona, Mateo Kovacic nke Real Madrid, Sulley Muntari nke Deportivo La Coruna. 2017/2018 Onye ọgba n'etiti a gbachara bọọlụ nke afọ a na-enyeteghi otu goolu ọbụla n'asọmpi niile dịka ọ kwụsịrị ịgbara Manchester City bọọlụ. O nyere goolu dị 62, enyemaka dị 32 n'ime asọmpị 230 ọgbara otu ya na Premier League. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ndu otu Manchester United mechiri afọ 2017/2018 na-enyeteghi goolu ọbụla. Onye ọgba n'etiti a dị afọ 36, kwuru na ọ gbachala n'ọgụgụ afọ, gbara asọmpi dị 463 mabute iko dị 12 na Manchester United. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti a gbaara ndị otu Eagles bọọlụ ugboro 30 na-enyeghị goolu ma ọ bụ enyemaka ọbụla. N'oge ya niile n'asọmpi Premier League dị 174 ọgbara, o nyere goolu dị 26. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ndị Barcelona mechiri afọ a na-enyeghi goolu ọbụla n'asọmpi 34 ọgbara. Agbanyeghi na nwafọ mba Portuguese nyere goolu mgbe barcelona zutere ndị Mamelodi Sundown na Johannesburg n'ọnwa Mee. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ebe ihu a chere n'asọmpi ikpeazụ europa league iji nyeta otu ọkpụ goolu n'afọ a. Gabi gbara asọmpi dị 51 n'afọ a. Nwafọ Spen gbaara asọmpi 400 na Atletico Madrid nakwa Zaragoza. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Nwafọ mba Kọrọsịa gbara asọmpi dị 32 na Real Madrid na-enyeghi goolu ọbụla. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Ọgbaara ndị Deportivo asọmpi ugboro asatọ n'ime afọ na-enyeghi ọkpụ goolu ọbụla. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba bọọlụ n'etiti azụ gbaara ndị PSG asọmpi ugboro 19 n'afọ a na-enyeteghi otu goolu. Nwafọ mba Fransị gbaara otu egwuregwu dịka Real Madrid, Chelsea na Arsenal bọọlụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Azuibuike bụ nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ n'asompi mbụ ndị Turkey. Mana ọgba bọọlụ n'etiti a bụ onye ndu otu Malatyaspor enyeghi goolu ọbụla n'ime asọmpi 26 ọgbaara otu ya. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ndị Liverpool nyere goolu asa n'ime asọmpi 36 ọgbara n'afọ gara aga. Mana o nyebeghi goolu ọbụla n'afọ a agbanyeghi na ọ gbaala asọmpi dị 33. Onye ọgba n'etiti a gbachara bọọlụ nke afọ a na-enyeteghi otu goolu ọbụla n'asọmpi niile dịka ọ kwụsịrị ịgbara Manchester City bọọlụ. O nyere goolu dị 62, enyemaka dị 32 n'ime asọmpị 230 ọgbara otu ya na Premier League. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ndu otu Manchester United mechiri afọ 2017/2018 na-enyeteghi goolu ọbụla. Onye ọgba n'etiti a dị afọ 36, kwuru na ọ gbachala n'ọgụgụ afọ, gbara asọmpi dị 463 mabute iko dị 12 na Manchester United. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti a gbaara ndị otu Eagles bọọlụ ugboro 30 na-enyeghị goolu ma ọ bụ enyemaka ọbụla. N'oge ya niile n'asọmpi Premier League dị 174 ọgbara, o nyere goolu dị 26. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ndị Barcelona mechiri afọ a na-enyeghi goolu ọbụla n'asọmpi 34 ọgbara. Agbanyeghi na nwafọ mba Portuguese nyere goolu mgbe barcelona zutere ndị Mamelodi Sundown na Johannesburg n'ọnwa Mee. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ebe ihu a chere n'asọmpi ikpeazụ europa league iji nyeta otu ọkpụ goolu n'afọ a. Gabi gbara asọmpi dị 51 n'afọ a. Nwafọ Spen gbaara asọmpi 400 na Atletico Madrid nakwa Zaragoza. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Nwafọ mba Kọrọsịa gbara asọmpi dị 32 na Real Madrid na-enyeghi goolu ọbụla. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Ọgbaara ndị Deportivo asọmpi ugboro asatọ n'ime afọ na-enyeghi ọkpụ goolu ọbụla. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba bọọlụ n'etiti azụ gbaara ndị PSG asọmpi ugboro 19 n'afọ a na-enyeteghi otu goolu. Nwafọ mba Fransị gbaara otu egwuregwu dịka Real Madrid, Chelsea na Arsenal bọọlụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Azuibuike bụ nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ n'asompi mbụ ndị Turkey. Mana ọgba bọọlụ n'etiti a bụ onye ndu otu Malatyaspor enyeghi goolu ọbụla n'ime asọmpi 26 ọgbaara otu ya. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Onye ọgba n'etiti ndị Liverpool nyere goolu asa n'ime asọmpi 36 ọgbara n'afọ gara aga. Mana o nyebeghi goolu ọbụla n'afọ a agbanyeghi na ọ gbaala asọmpi dị 33. Ndị nwe Foto ndị a Ndị nke na-agba na Fransị bụ Lassana Diarra nke PSG. Nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na Malaysia bụ Okechukwu Azuibuike so na ndị a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49190685,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49190685,Nafdac: Ịtụbata ọgwụ ka uru karịa ịkụ ya - Azubuike Chukwumereije,Ndị na-akụ ọgwụ n'ala Igbo akọwala ihe mere ọgwụ a na-atụbata ji karịa nke a na-akụ na Naịjirịa.,"Onye ọkụ ọgwụ bụ Azubuike Chukwumeriji sị na-atụmatụ gọọmenti hibere maka ịchekwa ya bụ ọrụ karịrị ike, na-eri oge ma dịkwa okeọnụ. Azubuike sị na-enweghị akụrụngwa, na oke ụtụisi a na-ana ha bụ ụfọdụ ihe n'echere ha akamgba na ya bụ ọrụ. Ọ sị, "" ego ọ na-eri anyị iji mepụta ọgwụ karịrị ego eji atụbata otu ọgwụ ahụ. A na-anakwa anyị ọtụtụ ụtụisi tinyere enweghị ọkụ bụ nke na-adọhachị anyị akaelekere azụ"". Azubuike maraatụ na ya ma ndị otu ha mechichere ebe ha na-akụ ọgwụ gazia bubatawa ọgwụ maka nsogbu ndị a. N'agbanyeghị nke a, ọ sị na ụfọdụ ndị otu ha anaghị enwe ndidi ka ọrụaka ha mitawa mkpụrụ, na ha chọrọ ego ọkụọkụ nke taa nke echi. Otu na-ahụ maka ịchekwa ọgwụ na ahịa ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) kwuru na ụzọ asaa n'ime iri bụ ọgwụ a na-aṅụ na Naịjirịa sị mba ofesi, ebe atọ nke ọzọ si obodo a. Ebe ndị na-akụ ọgwụ na-eche na ọ ka mma ka ọtụtụ ọgwụ a na-ego na Naịjirịa sị obodo a, onyeisioche ụlọọrụ Nafdac, bụ Ọkankuzi (Prof.) Mojisola Adeyeye sị na ihe ka mkpa bụ nke onye na-eme ya mee ya nke ọma. Azubuike Chukwumerije na-akọwa na ọgwụ ikpo asaa a na-atụbata na Naịjirịa gosiri ego ole sị mba a aga ofesi n'ihi ọgwụ, bụ nke ekwesiri iji tinye n'ọrụ wee ndị mmadụ ọrụ. Mbọ niile BBC gbara ị nụ ọnụ okwu onyeisioche ndị Pharmacitical Society of Nigeria bụ Sam Ohuabunwa amịtaghị mkpụrụ. Akụkọ ga-amasị gị Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" afirika-43979186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43979186,Dino Melaye sị ụlọọgwụ bịa ụlọikpe taa,Ndị uweojii n'Abuja buuru omeiwu Dino Melaye bata n'ụlọ ịkpe taa n'elu akwa.,"End of Twitter post, 1 Cheta na kemgbe izuuka garaaga ka ndị uweojii na-eche Melaye nche n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụ. Dino Melaye meruru ahụ oge o sị mpio ụgbọala wụpụo mana okaiwu ya kwuru na ọ bụ ndị uweojii kwapụrụ Dino Melaye. Ndị ntaakụkọ Sahara Reporters dere na ọkaịkpe kpebiri na ọ bụ nde naira 90 ka ha ga-eji were nye Melaye ohere ka ọla be ya wee ruo mgbe ipe ya ga eru. Ndị uweojii na-ebo Dino Melaye bụ onye omeiwu na nọchịte mpaghara ọdịda anyanwụ nke Kogi steeti ebubo na o nyere ndị na-akwado ya ngwa agha. Mana Melaye kwuru na ebubo a bụ asị. Ụfọdụ nsogbu Dino Melaye nwere Dino Melaye na gọvanọ Kogi anaghị ahụ ibe ha anya na anya n'agbanyeghị na ha nọrọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị. N'ime izuụka garaaga, Melaye meriri na nyocha ngalaaba na-ahụ maka ntuliaka mere maka mkpọghachị azụ achọbụrụ ime ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51102879,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51102879,Supreme Court Judgement: Hope Uzodinma emeriela dịka gọvanọ Imo steeti,Ụlọikpe Kachasị na-anọkọ ikpe ikpe Gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo state enyela Hope Uzodinma mmeri na mgbede a.,"Mkpebi gbara ọkpụrụkpụ ha kpebiri: Cheta na izuụka abụọ gara aka, Fada Mbaka mụnyere ọkụ na soshal midia dịka o buru amụma na Uzodinma ga-eweghara oche Gọvanọ Imo steeti. Chetakwa na ha higharịrị ikpe Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti gaa ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Jenuwarị 2020. Ebe a ka ha ga-ama onye meriri ntuliaka gọvanọ steeti ha dịka ụlọikpe ukwu ga-ekwu. Rochas ekelela Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe Rochas Okorocha chịburu Imo steeti afọ asatọ tupu Emeka Ihedioha abanye n'oche ahụ Aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekelela gọvanọ ọhụrụ bụ Hope Uzodinma maka mmeri ya n'ụlọikpe Kachasi Okorocha onye bụ Sinetọ na-anọchite Imo-West n' ụlọ omeiwu ukwu kelekwara otu APC maka mmeri ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na kwuru n'ozi nke ọ nụ na-ekwuru ya bụ Sdam Onwuemedo binyere aka na ga na-enye ọchịchị Uzodinnma ezi nkwado. Ihe mere n'ụlọikpe kachasị ụbọchị 14/01/2020 Ụlọikpe 'Supreme Court' juru n'ọnụ maka mkpebi ikpe ndọrọndọrọ ọkwa gọvanọ maka steeti ise nkd Imo bụ otu n'ime ha Ọkaikpe Tanko Muhammad, bụ onyeisi mmadụ asaa ndị ọkaikpe kpere ya bụ ikpe yighariri ya ka o gechara mkpesa ọkaiwu ndị ikpe ahụ metụtara. Abba Kabiru-Yusuf, bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Kano steeti n'otu PDP, na-arịọ ka ụlọikpe kachasị kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ. N'otu aka ahụ kwa ka ndị otu APC na-arịọkwa ka a chutuo Ihedioha n'ọkwa gọvanọ. Lee onyonyoo etu ndị ọkaiwu si jupụta n'ụlọikpe 'Supreme Court' n'ụtụtụ Tuzde: Ọkaiwu Mike Ozekhome Akụkọ na-abịa." afirika-50712067,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50712067,Youth Empowerment: Ị ma ntorobịa bụ 'ewu akpụkpa ntị'? Lee etu ị ga-esi kwa nku ya,Ị ma ntorobia na-eme isi ike maọbụ nke a na-anaghị ata ntị ya ata? Anyị chọrọ ịgwa gị etu ị ga-esi kwa nku ya.,"Dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-enupu isi, na-eti ndị nkuzi ha ihe, nakwa ndị nke na-eti ibe ha ihe, akparamagwa ndị a so na ndị na-enye ndị nne na nna na ndị ọzọ nchekasị gbasara ọzụzụ ha. Ndị Afrịka kwenyere na otu onye anaghị enwe nwa, nke bụ na nwatakịrị gbaa isi akwara na ọ gaghị akpazi agwa ọfụma, ụfọdụ ndị ga-achọ itinye aka hụ na ọ pụtara mmadụ. Ụfọdụ ihe ndị ntorobịa na-enye nsogbu na-eme: BBC Igbo kpọrọ ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ọha ebe ọ metụtara ndị ntorobịa, ndị gwara BBC Igbo etu ị ga-esi ejikwa ntorobịa. Etu ị ga-esi jikwa ntorobịa na-enye nsogbu: Ihe ọma ị ga-emenwuru ntorobịa na-eme isi ike bụ igosi ya na ị bịaghị ịta ya ụta, na ọ bụ enyi ya ka ị chọrọ ịbụ. Gosikwa ya site n'inye ya ntuziaka si n'ihe ị mụtara ka ị na-eto, ahụmihe ị hụrụla n'ụwa nakwa ihe ndị ị mụtarala n'ahụmihe ndị ọzọ ọkachasị gbasara ọnọdụ ọ nọ mgbe ahụ. Na-akpanyere ha nkata, kpọrọ ha pụọ apụ, ebe ị ga-esonwu ya mee ihe ga-enye ya ọṅụ, ka o nwee ike inye gị ohere ịmata ihe na-aga n'uche ya. Ime nke a ga-egosi ya na ọ bụghị nkarị ka ị chọrọ igosi ya, kama na ọ bụ ihe ọma ka ị chọrọ imere ya. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ nwee ike ịbịakwute gị ma o nwee nsogbu. Ntorobia meta ihe e ji abara ya mba dịka ịlụ ọgụ maọbụ imebi ihe, buru ụzọ gee ya ntị mara ihe mere o ji mee ihe o mere; kama ibido bawa mba maọbụ iti ya ihe. Ịjụ ya ụdịrị ajụjụ nchọpụta a ga-eme ka i nwee ike ịmata ihe mere o ji kpaa ụdịrị agwa ahụ ọ kpara mgbe ahụ, ma mara etu ị ga-esi gbochie ya ka ọ ghara ime ọzọ. Kama ịbụ 'onye oke ekwurekwu', bụrụ onye 'oke omume'. Nke a bụ makana ụmụaka na ntorobịa na-aka amụta ihe site na ṅṅomi karịa site n'ihe ị gwara ha mee. Ị ga-agba mbọ hụ na ị na-eme ihe ọma n'akụkụ ha, ka ha nwee ike si n'ahụmihe gị mụrụ akọ. Ịtụkwasị mmadụ obi dị ka inye ya ọrụ nke a na-akpọ 'Responsibility' na Bekee. Ọ mara na ị nwere ntụkwasị obi n'ụdịrị mmadụ ọ bụ, ọ ga-agba ezigbo mbọ hụ na wụghị gị n'ala. Ọ gaghị achọ ka o meta ihe ga-emenye gị ihere maọbụ mee ka ị hụ ya ka onye abaghị uru. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?" media-53356311,https://www.bbc.com/igbo/media-53356311,Imo State Police: Etu onye a sị bụ onye uweojii si gbagbuo mmadụ n'Orlu n'ihi eyighi 'Facemask',Akụkọ na-efegharị na-ekwu na onye a sị bụ onye uweojii gbagburu otu nwoke n'Orlu Imo Steeti maka na o yighi 'Facemask'.,"Akụkọ kwuru na nke a mere n'ebe a na-akpọ 'Banana Junction' dị n'Orlu. Anya hụrụ ka ihe si mee na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị na onye e gburu bụ onye ọgbatumtum nke e ji ọkada mara. Nwoke ahụ kwọ mmadụ rute na nkewa ụzọ a kpọrọ 'Banana Junction' mgbe onye a sị na ọ bụ onye uweojii kwụsịrị ya maka na o kpuchighi ihu. Onye a sị bụ onye uweojii sị ya weta ego tupu ọ gafee ebe ọ bụ na o yighi 'Facemask' mana nwoke a jụrụ. Nke a butere nrụrịtaụka n'etiti ha abụọ, onye a sị bụ onye uweojii wepụtara egbe ma gbagbuo nwoke ahụ. Ndị ntoroọbịa nọ ebe ahụ malitere ime ngagharịiwe maka ọnwụ nwoke a. BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Godson Orlando Ikeokwu mana ọ zaghị ekwe ntị ya. E zigakwara ya ozi banyere nke a, ọ zaghachibeghi rute mgbe akụkọ a pụtara. Akụkọ ka na-abịa... Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49646031,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49646031,Shiite Procession: Ndị otu IMN kachiri ntị mee ngagharị,"Ndị otu Islamic Movement in Nigeria, bụ ndị e jikwa ""Shiites"" mara, kachiri ntị mee ngagharị na steeti dị icheiche na Naịjiria.","Ndị otu IMN wepụtara foto a n'akara Twitter ha, na-ekwu na ngagharị ha gara n'ihu n'Abuja. Ngagharị a bụ nke ha ji eme emume nke ndị ụka Alakụba kpọrọ ""Ashura"". Nke a bụ n'ihi na gọọmentị Naijiria na-ahụtazị otu IMN dịka ndị oyi egwu. Mana akụkọ si Abuja wee pụta n'ụtụtụ a kwuru na ndị IMN mere ngagharị iwe n'ụtụtụ na mpaghara Wuse n'ụbọchị Tuesday. Ọnụ na-ekwuru ndị IMN bụ Ibrahim Musa gwara BBC na ha nwere ngagharị n'ezie nke bidoro na Wuse we ruo mpaghara Berger. O kwukwara na ndị otu ha mekwara ngagharị na Kaduna Steeti mana ha na ndị uweojii kwakọtara isi nke mere ka mmadụ atọ nwụọ. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna steeti kwuru na o nweghị onye ha gburu kama ha chụsasiri ha achụsa. Ndị otu IMN sikwa n'akara ""Twitter"" ha wee kwuo na ha gbakọrọ ime ngagharị na Sokoto Steeti, mana ndị uweojii ekweghi ha zọpụ ụkwụ. Ndị uweojii ekwubeghi ihe ọbụla banyere ebubo ndị a. Anjuguri Manza, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja azaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị. Ọ zaghachighikwa ozi ""SMS"" anyị zigaara ya. BBC ka na-eme nchọpụta iji mata nke bụ eziokwu n'ihe niile a. Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu dọsiri aka na ntị ike n'ụbọchị Mọnde gbasara ngagharị ndị IMN. Adamu kwuru na ndị uweojii ga-akpaso onye ọbụla so mee ahụ ngagharị ahụ agwa dịka onye oyi egwu. Frank Mba, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, kwukwara na ọbụ naanị ndị IMN ka a machiri ime ngagharị. Mba kọwara na ndị ụka Alakụba ndị ọzọ nwere ike ime emume ""Ashura"" dịka ha si emebu. Mana onye ọbụla emekwala ihe megidere iwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-48620036,https://www.bbc.com/igbo/media-48620036,Mother to child HIV transmission: Ụzọ ị ga-esi gbalahụ ibufe nwa ọhụrụ gị HIV,"Dịka ọ na-ewu na Naịjirịa bụ mba ebe ụmụaka nwere nje HIV site n'afọ nne ha maọbụ mgbe a na-amụ ha kacha n'ọnụ ọgụ, ọ dị mkpa ịme ka ọha na eze mata ka a ga-esi gbochie ụdị ọgbatauhie a.","Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochị HIV/AIDS bụ National Agency for the Control of AIDS (NACA) depụtara ihe ndị n'ọbaozi ha. Ihe ị kwesiri ịmata maka ibufe nwa amụrụ ọhụrụ nje HIV Nwa bu nje HIV na nne ya Nje HIV nwere ike ị banye nwa amụrụ ọhụrụ n'ahụ sịte n'ahụ nne ya, mgbe ọ nọ n'afọ, mgbe a na-amụpụta ya maọbụ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya. Ihe a bụ ụzọ ụmụaka si ebutekarị nje HIV. A na-enye nwaanyị dị ime nwere nje HIV ọgwụ HIV ka ewere gbochie ụmụ ha ibute ya bụ nje. Mgbe ụfọdụ a na-eyiagba mgbe a ga-awa nwaanyị dị ime bu HIV afọ maka ikupute nwa dị ya n'afọ ka ọ ghara ibute ya bụ nje. A na-enye nwa nne ya bu ya bụ nje ọgwụ mgbochi ọnwa isii ka amụchara ya. Na mba ụfọdụ, a na-akwụsị nwaanyị bu nje HIV inye nwa ọhụrụ ha ara maka ibufe ya nje ahụ. Kedụ ka usoro a si egbochi ibufe nwa amụrụ ọhụrụ nje HIV? A na-enye nwaanyị dị ime bu nje HIV ọgwụ mgbe ọ dị ime na mgbe ọ mụrụ nwa. Mgbe ụfọdụ, enwere ike iyiagba mgbe a aga-awa ya afọ kuputa nwa ahụ ka nje ahụ ghara ịba ya ahụ. Centers for Disease Control and Prevention (CDC) kwụrụ na ọ dị mkpa ịnyocha nwaanyị ọbụla di ime nje HIV ngwa ngwa ọ dị ime. Nwaanyị ọbụla bu ya bụ nje kwesiri ịmalite ṅụwa ogwu ya ozugbo iji belata ibufe nwa ya nje ahụ. Ọgwụ ahụ na-enyere ha aka ibite ndụ aka, nwekwaa ahụike ma mekwa ka ọ ghara ibufe nwa ya nje ahụ. Kedụ ka ọgwụ a si arụ ọrụ a? Eji nchịkọta ọgwụ HIV agwọ ya bụ nje ugbua Ọgwụ a na-ebutu ọnụọgụgụ nje HIV dị mmadụ n'ahụ nke ga-eme ka ọ ghara inwe ike ịba nwa ya n'ahụ mgbe ọ nọ n'afọ maọbụ mgbe ọ na-amụ ya. Ibuda ọnụọgụgụ nje HIV na-emekwa ka nwaanyị bie ezigbo ndụ n'ahụike. Ụfọdụ ọgwụ ndị na-esikwa n'afọ nne baa nwa n'ahụ site na mgbiriafọ ya bụ nke Bekee kpọrọ afterbirth. Ụzọ a na-eme ka nje a ghara ịba nwa ọhụrụ n'ahụ okachasị mgbe a na-amụpụta ya. Akụkọ ga-amasị gị Ihe ị kwesiri ị ma maka akpụ ori nwa." afirika-50372545,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50372545,Gastroenteritis: Ọrịa gburu mmadụ 11 n'ime ihe karịrị 317 ofesara na Lagos - Mịnịstrị ahụike,Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti gwara BBC na ọ bụ naanị mmadụ iri na otu nwụrụla n'ime ihe karịrị mmadụ narị atọ na iri asaa butere ọrịa gastroenteritis na-efegharị na Legọs.,"Tubosun Ogunbanwo bụ onye na-achịkọta mmekọrịta mịnịstrị ahụ na ndị mmadụ, kwuru sị na ha ejikpaala ọrịa ahụ mana sị na ọ ka nwereike iselite isi ma mmiri ozuzo ka na-ezo. Ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaa mbọ na-edowe onwe ha ọcha ma gbaara ụfọdụ nri dị ka ihe si n'oke osimiri a na-esighi esi ọsọ. A na-atụ ndị isi ezughi oke ịga na Naịjiria End of Twitter post, 1 Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru mmadụ a kpọrọ Human Rights Watch akatọọla etu e si atụ ndị isi na-ezuchaghị oke ruru puku kwuru puku ịga ma kpọchie ha ebe ha na-anọ emegbu ha na Naịjirịa. Ha kwuru na ịtụ ịga a na mmegbu a abụghị naanị n'ụlọọgwụgwọ ka a na-eme ya, na o ruchara ma n'ụlọekpere ma nke ụka Kraịst ma nke alakụba, nakwa nke ndị ọdịnaala. Okwu a sonyere nzọpụta ndi uweojii zopụtara ndị mmadụ nọ n'ụdịrị ọnọdụ a na steeti dị iche iche. Ndị uweojii egbuola mmadụ abụọ Ndị uweojii mba Rwanda agbagbuola mmadụ abụọ si mba Uganda na nso oke ala ha. Ndị uweojii mba Uganda kwuru na ha na-enyocha ogbugbu mmadụ abụọ a ndị ogbo ha na Rwanda na-ekwu na a gbagburu maka esighi ụzọ ziri ezi gafee oke ala mba abụọ a. Nke a e meela ya ihe karịrị mmadụ iri a na-agbagbu maka otu ihe a kemgbe ọnwa Febrụwarị. Ndị uweojii anwụchiela onye otu ha A nwụchiela otu onye uweojii e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-ana akaazụ. Ndị uweojii kwuru na ha na-ekpe Sajent Onuh Makedomu ikpe imeụlọ maka nrụrụaka. Mana ndị mmadụ achọghị ịnụ nke ahụ, makana ha malitere ikwu na ọ bụghị taa ka ha nụwara maka 'nwụchi ndị uweojii'. Ihe CAN gwara NYSC Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ngalaba na-achịkọta ndị ụka kraịst na Naịjirịa bụ CAN, etinyela ọnụ na nchụpụ a chụpụrụ mmadụ abụọ n'ebe ha na-efe ala nna ha n'Ebonyi steeti. Rev Adebayo Oladeji kwuru na ekwesịghị ime ụmụagbọghọ ahụ ihe e mere ha maka nkwenye ha n'okwukwe ha. O kwukwara na ngalaba NYSC kwesịrị ịnabata ụfọdụ ihe. Ngagharịiwe Họng Kọng, Oge a gbara onye na-eme ngagharịiwe egbe gosiri n'elu 'nke na-eme ugbua' na Facebook Mgbọ atụla mmadụ na mba Họng Kọng dịka onye uweojii gbara otu onye na-eme ngagharịiwe egbe. Nke a ga-eme ya ugboro atọ onye uweojii na-agba mmadụ egbe kemgbe ọnwa Juun nosgbu a bidoro. N'egwuregwu, Kenneth Omeruo na Samuel Kalu so na ndị egwu Super Eagles tụgoro down n'Uyo ebe ha nọ akwado maka asọmpi ndị ga-etozu ịga Afcon nke 2021. Mara na Naịjirịa ga-ezute Bene Repọblik n'ụbọchị Wenesde bụ abalị iri na atọ nke ọnwa a. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria" afirika-53504948,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53504948,Etu ụlọelu ogogo atọ si daa n'Abakaliki,"Ụlọelu ogogo atọ dị n'akụkụ isiụlọọrụ okpuruọchịchị Abakaliki n'Abakaliki ,isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Tuzde.","O nweghị onye nwụrụ maọbụ meruo ahụ na ya bụ ihe mberede mana ndị bi nso ebe ahụ kọrọọla BBC Igbo ihe ha hụrụ tupu ya bụ mkpamkpa akpaa. Ijeoma Uchenna Mbam bụ onye bị n'akụkụ ya bụ ụlọ na di ya huru ka igwe e ji rụọ ya bụ ụlọ malitere ịmịpụta kemgbe Izuụka atọ gara aga bụ mgbe o jiri kpọtụrụ ndị ọzọ ka ha soro ya hụ ihe ya na ahụ. Ijeoma sịkwa na di ya kpọtụkwaara ndị ọrụ 'Capital Territory Development Board' mana ha bịaghịzị tupu ya bụ ụlọ a daa na ihe dịka elekere iri na otu nke abalị ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị. Nwokora Christopher kelere Chineke ka o siri zọpụta ya na ezinaụlọ ya na ya bụ ụlọ dakwarasa mgbaaja ụlọ ha. Ụlọ Nwokora Christopher bụ ebe ụlọ ahụ dakwasara mgba aja ha Ọ gwara BBC Igbo na""anyị kelere Chukwu maka na anyị amaghị na ya bụ ụlọ ga-adakwasị mgbaaja ụlọ anyị"". Nwokora takwara ịnjinia na-arụ ya bụ ụlọ ụta dịka onye aka ọrụ ya riri mperi. Nwankwo Jude bụ onye hụrụ ihe mere sị na aja karịrị simenti e ji rụọ ya bụ ụlọ, na ọ bụ ya mere ya bụ ụlọ jiri daa. Chinyelu Udoku, onye enyemaka Kọmishọna na-ahụ maka isiobodo Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa na udo okeala na ndị ọrụ ya e ruola ebe ya bụ ụlọ dara ma nyekwa iwu ka agbachie ebe ahụ ogige ma nwuchie injinịa rụrụ ya bụ ụlọ ozigbo ozigbo. Ọ dọkwara aka na ntị ka ndị ọbụla bi nso ebe ahụ nye efe maka mmeru ahụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51223225,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51223225,"Corruption Perceptions Index: Obasanjo,Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi- Onye ọrụ Buhari",Onye nnyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Muhammad Buhari bụ Laurette Onochie na-arụ Olusegun Obasanjo na Oby Ezekwesili aka maka ajọ aha nnyocha Transparancy International nyere Naijiria na nsonso a.,"Nnyocha nke otu na-eme ngụkọ maka ịkwụba aka ọto n'ụwa niile bụ ""Transparency International"" gosipụta na Naijirịa kpụụ afọ n'ala ada ngụkọ mba na-akwụba aka ọto nke afọ 2019. Ha kwuru na Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Mana Onochie kwuru na nnyocha ha adabaghị n'ihi na ọ bụ ndị 'iweobi' Obasanjo na Oby Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi n'ihi na ọ bụ ha hiwere otu Transparency International. O gara n'ihu gwaa ụmụ Naijria ka ha ghara iji nnyocha ahụ Transparency International wepụtara kpọrọ ihe. ""Onyeisiala Buhari bụ onye ọkaibe n'ibu agha megide nrụrụaka n'Afrịka."" Na-agbanyeghị na ọchịchị Buhari na-etisi mkpu ike sị na ha na-ebu agha megide nrụrụaka, nnyocha Transparency International kwuru na Naijiria na-agba ọnụba. Mana ya bụ nnyocha na-arụ ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka dịka EFCC na ICPC afọ. N'onwe ya Ezekwesili onye sị okwu Collin Powell tụọ ilu kwuru na ọ bụ kụrụ ka ọ ga-aghọrọ. O kwuru n'akara Twitter sị' ""Okwu Collin Powell nke sịrị na 'O nweghị ụzọ nzuzo e si enwe ọganihu karịa nkwado, itinye uchu nakwa ịmụta ihe site na ọdịda' bụ ihe gbatara m n'obi oge m hụrụ nnyocha Corruption Perception Index ọhụrụ."" Nrụrụaka n'ọdịda anyanwụ Afrịka: Naanị Chad, Guinea Bissau na Cameroon ka Naịjirịa ka mma Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Nke a bụ dịka nnyocha ọhụrụ ndị otu 'Transparency International' wepụtara n'ụbọchị Tọzde si kwuo. Naanị Cameroon, Chad nakwa Guinea Bissau ka Naịjirịa ka mma na mpaghara ọdịda Anyanwụ Afrịka. N'Afrịka niile Naịjirịa gbara 33 n'ime mba 48 e nyochara. N'ụwa niile, nnyocha ahụ gosiri na Naịjirịa bụ ndị nke 146 n'ime mba 180. Nke a bụ na-agbanyeghi na ọchịchị Muhammadu Buharị etuola ọnụ na ha ebutuola nrụrụaka na Naịjirịa. Ọ bụ kwa afọ ka ha na-edepụta etu mba uwa niile sị kwuba aka ọtọ Otu 'Civil Society Legislative Advocay Centre' (CISLAC) nke bụ otu na-anọchite anya 'Transparency International' kọwara ihe nrụrụaka jị aka njọ na Naịjirịa. Auwal Rafsanjani, onyeisi otu CISLAC kwuru na gọọmentị etiti ka na-enupu isi nye mkpebi ụlọikpe. Rafsanjani kwukwara na nrụrụaka na ndọrọndọrọ ọchịchị bawanyere na Naịjirịa n'afọ gara aga. Ndị nyere aka na nyocha a Lee ka ụfọdụ mba ndị ọzo bụ agbata Naijirịa sị kwụrụ Ihe gọọmentị kwuru Abubakar Malami bụ Ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti Mana gọọmentị etiti ekwenyeghi n'ihe ndị Transparency International kwuru. Ọkaiwu ukwu bụ Abubakar Malami kwuru na otu ahụ ejighi ihe akaebe ọbụla wee mee ya bụ nnyocha. Malami kwuru na ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari emeela ka nrụrụaka gbadata nke ukwu na Naijiria Ọ gara n'ihu maa Transparency International aka n'ihu ka ha gosipụta etu ha si mee nnyocha ha. 'Lassa Fever' ka na-akpa ike Eburula Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti. Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti. ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti. Mmachị obodo Wuhan nke dị na China Nje Corona egbuola mmadụ iri na asaa na mba China Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS. Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan. Ọkụ Ọstrelịa Ọkụ a egbuola otutu mmadụ ma mebie kwa ihe Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa. Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019. Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa." afirika-43194327,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43194327,Dapchi: Gọọmenti sị na ha tinyere uju n'ịchọ ụmụakwụkwọ a tọọrọ,"Gọọmenti Naịjirịa na-akọwa na ha ezipụla ụgbọelu na ndịagha ọhụrụ, ha tinyere na nke ha zipụrụ na mbụ maka ihu na hụrụ ụmụaka 110 na-efụ na Dapchi, Yobe steeti.","Ụlọ akwụkwọ umụnwaanyi na Dapchi ke mechiri emechi Ụmụakwụkwọ a fụrụ mgbe ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram wakporo ụlọ akwụkwọ ha na ụbọchị 19 nke Febụwarị nke afọ a. Onyeisiala Mohammdu Buhari kpọrọ ihe mere ụmụakwụkwọ a 'ọdache metụtara Naịjirịa niile' ma rịọ nne na nna ụmụakwụkwọ a mgbaghara. Mwakpo a mere ka ndị mmadụ cheta ihe mere mgbe Boho Haram nwụchịkọrọ ụmụakwụkwọ na Chibok n'afọ 2014. Ndị nwe ụmụakwụkwọ a na-efu na-ajụ ndị gọọmenti ajụjụ Iwe na ewe nne na nna ụmụnwaanyị a na-efu ka akuko na-apụta na-ewepụrụ ndịagha nọ ọrụ nchekwa na Dapchi n'ime ọnwa gara aga. Awakporo Dapchi, nke nọ ihe dịka 275km (170 miles) n'ugwu ọdịda anyanwụ Chibok, n'ụbọchị Mọnde gara aga, mere ụmụakwụkwọ na ndịnkụzi nọ na ụlọakwụkwọ Government Girls Science and Technical College ịgbaba ọhịa nọ ha nso. Ndị nwe ụmụakwụkwọ Dapchi na ewe iwe Ndị bi Dapchi na-akọwa na ndịagha Naịjirịa ji ụgbọelu na ndịagha gbochie ma chụna ndị a na awakpo obodo a. Na mbụ, ndị gọọmenti Naịjirịa gọọro na onweghi nwata akwukwọ atọọro, ma na-akọwa na ha no ọhịa na ezoruru ndi oji egbe a. Mana ha mechara kweta na ụmụakwụkwọ 110 na-efuka mwakpo a mechere. Edepụtala aha ndị na-efu na Dapchi Ndi Boko Haram na ebuso gọọmenti Naịjirịa agha iji kepụta mba alakọba na ụwụwa anyanwụ na ugwu Naịjirịa. Agha a egbuola mmadụ puku puku, ma mee ka atọọrọ puku puku ndị ọzọ." 49017371,https://www.bbc.com/igbo/49017371,Fulani herdsmen Crisis: Aka akparala onye Fulani ọchịehi bu akpa mgbọ egbe akpagharị,Otu onye Fulani ọchịehi ejejiela chi dịka a nwụchiri ya Tuzde e be obu akpa mgbọ egbe akpagharị.,"Mgbọegbe Nke a mere n'obodo a kpọrọ, Obudi Agwa Autonomous Community nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta n'Imo Steeti. Akụkọ kọrọ na ha dị ndị ọchịehi abụọ na-akpagharị n'ogbe ahụ, otu n'ime ha bu egbe ọgbatụwatụwa. Mana onye nke bu egbe gbalagara ọsọ. Ndị na-agba mgbere ehi Mgbe ha jụrụ onye nke ọzọ ihe dị n'akpa o bu, o kwuru na ọ bụ garrị. Ma mgbe ha naara ya akpa ahụ n'ike, mepee ya, ha hụrụ na ọ bụ mgbọ egbe juru na ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Imo steeti bụ Ikeogu Orlando gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu. Ọgbaaghara sitere n'aka ndị ọchịehi abụghị ihe ọhụrụ na Naijiria nakwa na Ọdịda Anyanwụ Afrịka O kwuru sị, ""A natara onye ọchiehi ahụ mgbọ egbe agbabeghi agba ruru iri anọ na abụọ. ""Anyị anwụchiela ya ugbua, ọ nọ n'ogige anyi, mana anyị ka na-eleba okwu ahụ anya"". Okwu banyere ndị ọchịehi na-arị elu na Naijiria ugbua. N'ọgbakọ ndị 'Northern Elders Forum' nwere ụbọchị Tuzde, ndị isi ndị Ugwu gwara umunne ha ka ha hapụ mpaghara ndịda ma lọtawa be ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi: Morocco nwa Maduka:" egwuregwu-50941364,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50941364,Arsenal vs Chelsea: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ,Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates.,"Goolu Tammy Abraham nyere na nkeji 87 na nke Jorginho nyere na nkeji 83 zuru iji tinye Arsenal n'ọnọdụ akwa arịrị na be ha. N'agbanyeghi na Pierre-Emerick Aubameyang nyerela Arsenal goolu na nkeji 13 e ji bido bọọlụ, o zughi ịkpọ ndị Chelsea ntu n'obi. Ka a batara ọkara nke Abụọ, ndị Chelsea gara n'ihu ka ebule e tinyere mma n'olu, wee jiri ajụ ọnwụ gbanye Arsenal goolu abụọ iji wee naghara ha pọịntị atọ. Ha ji mmeri a wee sị Mikel Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ ma bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha 'nnọọ'. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ji pọịntị 35 ka nọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League, ebe Arsenal ji pọịntị 24 nọ n'ogogo 12. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-43336462,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43336462,Emefiele: Nye ụmụnwaanyị ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ,Emefiele kpọrọ oku a taa n'Abuja mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme iji cheta ụbọchị ụmụnwaanyị n'ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ.,"Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria O kwuru na ọnọdụ e nwere ụgbua ebe ọ bụ sọọsọ mmadụ atọ n'ime mmadụ iri abụọ na asaa bụ ndị isi ụlọ akụ na Najiria adịghị mma. O kwuru na CBN enyewanyela ụmụnwaanyị ohere ịnọ na nnụkwụ ọkwa gbagoro sitere na otu nwaanyi ibụ diretọ n'afọ 2001 gbalie ga ụmụnwaanyị isii n'afọ 2017 ebe pacent ụmụnwanyi CBN were n'ọrụ gbaro site na pacent iri abụọ na anọ ga iri abụọ abụọ na asatọ. O kwuru na CBN mara mkpa ụmụnwaanyị dị n' ịnọ na nnukwu ọkwa nke mere ka ha nwe atụmatụ iji kwalite ha. ""Dika a matara na ụmụnwoke kachasị nọrọ na nnukwu ọkwa n'ọrụ ụlọakụ, the kọmịti na-ahụ maka ọrụ ụlọakụ nke a kpọrọ bankers' Committee n'aha bekee, ewpụtala quota ga-enye ụmụnwaanyị pacent iri atọ."" Emefiele kwuru na ọ dịkwa mkpa ka ụmụnwaanyị na-esonye n'ihe a na-eme ọnọdụ dị mkpa na ọrụ na-abụghị nke gọọmenti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46719983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46719983,Rochas: Ọ bụghị eziokwu na apụọla m n'APC,Akụkọ dị mkpa: Rochas a gọọla na ya hapụ r ụ APC,"Rochas Okorocha na ndị pati ya bụ APC na enwe ọgbaagha n'Imo steeti Rochas Okorocha agọọla ya apụọla na APC sị na akụkọ ahụ na-efegharị nke kwuru na ọ banyela otu Action Alliance(AA) bụ aka ọrụ ndị nwetara ohere ịzọ ọkwa n'Imo steeti site n'ụzọ akwụghị ọtọ. Ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Ọnwụemedo kwuru na Rochas ka nọ na APC ma kwukwa na ọ ga-aga n'ihu n' ikwado ntuliaka Onyeisiala Buhari n'afọ 2019. Ndị na-ahụ ka o si aga nwere afọ ojuju ka ntuliaka Congo si ga Dịka ndị mba Congo chị obi n'aka na-eche mpụtara ntuliaka ha mere, otu jịkọrọ mba nọ n'Afrịka bụ African Union(AU) na otu mwulite mpaghara Ndịda-anyanwụ Afrika bụ 'Southern African Development Community' kwuru na gọọmenti Congo gbalịlr na-ịchịkọ ntuliaka ahụ. Ndị na-ahụ ka o si aga (observers) kwuru na ha nwere afọ ojuju ka o si ga. Ha katọọ gọọmenti maka igbochi ụfọdụ ịtụ vootu mana kwuo na ha were afọ ojuju ka ihe siri gaa. Nke a bụ na agbanyeghị tigbuo-zọgbuo so ya bụ ntuliaka. Mana ha katọrọ gọọmentị maka igbochi ụfọdụ ndị mmadụ isonye tuo vootu na ntuliaka ha mere. E gbubiri intanet na mba ahụ ma gbochikwa mpaghara atọ ịtụ vootu na ntuliaka ahụ mere ụbọchịụka. Ụfọdụ ahụghị ozu nwanne ha n'ụlọozu gbara ọkụ Ndị ezinaụlọ nwere ozu n'ụlọozu gbara ọkụ awakpola ụlọọzụ ahụ ịgbali nweta ozu nwanne ha. Mana ụfọdụ na akwa akwa n'ihi na ha ahụghị ozu nwanne ha. Ọkụ gbara ozu karịrị 50 n'ụlọozu ụlọọgwụ Enugwu-Ukwu General Hospital,abali ole na ole gara aga. Otu Chelsea azụọla Pulisic Onye egwu bọọlụ bụ Christian Pulisic agalaa Chelsea ka a zụchara ya ego paụnd iri ise na asatọ (£58 million). Agbanyeghị na otu Chelsea egola ya, ọ ka ga na-agbara otu Dortmund bọọlụ rue na ngwụcha oge egwuregwu 2018-19. Nwa amala mba Amerịka ahụ kpara ike ka ọ wachara ka ọnwa n'oge 2015-2016. Site n'oge ahụ, ọ gbaalara ndị otu ya bụ Dortmund bọọlụ ugboro 115 na Bundesliga, ebe o nyere goolu 15 ma mepụta ohere inye goolu 24. Mana ọ na-adọlị n'akụkụ otu Lucien Favre ndị gbaliterela n'elu Bundesliga, dịka Bayern Munich anaghịzị ahụ azụ ha anya. Kemgbe afọ 2018, otu Dortmund eretala ihe karịrị nde narị ato na iri atọ(£330 million). Obi US n'Abuja sị ndị hakpọro oku bịa Obi US n'Abuja Obi mba US dị n'Abuja na Legọs ekwuola na ndị niile ha kpọrọ oku maka ajụjụ ọnụ inwete akwụkwọ ikike mba ahụ nwere ike ịbịa maka ya. Nke a bụ agbanyeghị na ụlọọrụ ha mechiri emechi maka ọrụ ndị ọzọ. Aisha Buhari bụzị onyeisi nta vootu Ụmụnwaanyị APC Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya E meela Aisha Buhari onye ndu achụmta vootu di ya bụ Muhammadu Buhari. Otu APC mekwara nwunye osote Buhari bụ Dolapo Osinbajo onye onyemaka Aisha n'otu ọrụ ahụ. Ohaneze akpọkụọla Igbo maka ịdị n'otu John Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze ndị Igbo Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ John Nnia Nwodo akpọkuola Igbo nọ na ụzọ na ndị nọ na ama ka ha do do do were otu uche na otu onu na-ekwu okwu mgbe niile. Nnia Nwodo kwuru nke a n'ọgbakọ ndị 'World Igbo Leadership' kpokobara na emume Ekeresimesi ha. Egwu ji INEC maka abụbụọrụ ndị ASUU Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015 Ndị ụlọọrụ INEC akpọọla oku ka ndị ọrụ nkuzi mahadum a kpọrọ ' Academic Staff Union of Universities,' ASUU, n'aha ịchafụ ka ha gbaa mbọ tọhapụ abụbụọrụ ha na-agbasa gọọmentị etiti. Ọnụ na-ekwuru INEC bụ Festus Okoye kwuru na abụbụọrụ a nwere ike imetuta ntuliaka 2019 maka na agaghị ahụ ndị na-efe ala nna ga-enyere ha aka n'ọrụ. Ndị nta egbuola mmadụ 37 na Mali E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo N'ofesi, Gọọmenti mba Mali ekwuputala na ihe ruru mmadụ iri atọ na asaa anwụọla n'aka ndị ha na-eche na ha bụ ndị dinta na mpaghara Mopti. Gọọmentị na-etinye anya n'arụ a bụ nke ha sị na ọ tara isi otu Eze a kpọrọ Moussa Dialo na ezinaụlọ ya. Ọ bụghị taa ka ndị Fulanị na-achi ehi na ndị ọrụugbo zowara ala na mmiri na Mali. Arsenal agbapụ Fulham mkpụrụọkwụrụ ọkwụrụ n'anya Arsenal N'egwuruegwu, ndi otu egwu bọọlụ Fulham agbaghị afọ ọhụrụ nke ọma dịka Arsenal ji ọkpụ anọ asatara otu nyuo ha anya n'egwuruegwu Premiere lig agbara ụbọchị Tuzde. Xhaka, Lacazette, Ramsey na Aubameyang bụ ndị gbara aka ahịa na ya bụ asọmmpi. Gee Gee Nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Christmas Travel: Ihe mere anyị ji etinye ego n'oge Ekeresimesi -Ekeson Akụkọ ga-amasi gị" 42856054,https://www.bbc.com/igbo/42856054,CCT si na Saraki ga-alaghachi ụlọ ikpe ha na Febụwari,Ụlọikpe Code of Conduct tribunal nke dị n'Abuja eyinyela abalị isii nke ọnwa febụwarị dịka ụbọchị Gọọmenti Etiti ga-emepegharị akwụkwọ ikpe ya megịde onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki.,"Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Danladi Umar bụ onyeisi oche ndị CCT kwenyere na mmepegharị akwụkwọ ikpe a megidere Saraki na nrube isi iwu ụlọikpe Appeal nke Abuja nyere n'abalị 12 nke ọnwa Dizemba 2017. Onyeisi ndị Sịnetị na-azara ọnụ ya n'ebubo dị iri na asatọ n'oge mbụ, ga-ebido zara ọnụ ya n'ebubo dị sọnsọ atọ. Ụlọikpe mkpegharị, nke a na-akpọ Court of Apeal na asụsụ bekee, n'ime nkwekọrịta ndị ọka ikpe ukwu atọ kwuru n'obi juru ha afọ na Saraki nwere azịza ọnụ n'ụlọ ikpe CCT Ụlọikpe a kacha pụrụ ebubo dị iri na ise nke eboro Saraki, kwuo na Gọọmenti etiti enweghị ihe akaebe pụtara ihe megide ya. Ndị akaebe anọ Gọọmenti Etiti kpọtara kwuru ihe ọzọ n'abụghị ihe Gọọmenti dere n'akwụkwọ. Ụlọikpe a sịrị Saraki bịa zara ọnụ ya n'ime ebubo nke anọ, ise na isii ebe ekwuru na okwuputaghị akụ na ụba ya mgbe ọ gbaturu n'ọchịchị dịka Gọvanọ ndị Kwara Steeti n'akwa tupu owere ọchịchị dịka onyeisi ndị Sịnetị. Saraki bụ onyeisi ndị Sịnetị nke mbụ enyere iwu ka akpọchịe Cheta na Bukola Saraki pụtara n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal nke Danladi Umar bụ onyeisi oche izara ebubo kwuru na ọ tụrụ asị na nkwuputa akụ na ụba ya mgbe ọ bụ Gọvanọ ndị Kwara Steeti Ebubo a kwuru na Saraki jụkwara ikwupụta ụfọdụ akụ na ụba onwetara dịka onye Gọvanọ." afirika-45594772,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45594772,Anambra Flood: Nwaanyị amụọla ụmụ ejima n'ụlọ gbatagbata,"Ka ndị mmadụ ọkachasi ndị bi na steeti dika Anambara so n'ebe idemmiri na-akpa mkpamkpa ugbua na-eche ka mmiri taa, ihe ọṅụ emeela.","Idemmiri a achụpụla ndị mmadụ na be ha na steeti kariri anọ na Naịjirịa Otu nwaanyị akpọrọ oriaku Obiora amụọla ụmụ ejima n'ụlọ ebe ndị gbatagbata kpọsara ndị idemmiri chụpụrụ n'Ogbaru dị n'Anambara steeti. Nwaanyi a mụrụ ụmụ ejima a ụbọchị September 20, bụ onye obodo Umuezeoma. Onyeisi okpuru ọchịchị Ogbaru bụ Arinzechukwu Awogu, kwuru na nwaanyị ahụ mụrụ ejima nwoke na nwaanyị. O kwuru: ""Ọ bụ eziokwu na otu nwaanyị mụrụ nwaanyị ebe a, gọọmentị akpọpụla ha n'ụlọ gbatagbata kpọga ha ụlọọgwụ maka ezigbo nleta."" Arinzechukwu kwukwara na o nwere nwata nwaanyị dị afọ itoolu nwụrụ maka ihe mberede idemmiri a. Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha. Gọọmentị Anambra ekwuola na ọ ga-eme ihe ọbụla o nwereike ime iji hụ na ha wetere ihe enyemaka a na-enye ndị idemmiri chụpụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47551343,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47551343,Building collapse in Lagos: Gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ,Gọọmenti Legọs steeti ebidola ịkpụta ụlọ ndị e kwuru na ha adịghị etu o kwesịrị na Ita Faaji dị na Lagos Island dị na Legọs.,"Ndị ọrụ gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ Ndị ọrụ gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ Ndị ọrụ gọọmenti ji mkporo igwe na-ịkụtusi ụlọ ndị a gbajọrọ kemgbe ihe karịrị otu afọ gara aga. Nke a na-eme na dịka mmadụ 11 nwụrụ n' n'ihe mberede ụlọelu dara na Legos. Ihe ruru mmadụ iri ise bụ ndị a zọpụtara, gụnyere ụmụakwụkwọ n'ime ụlọ ahụ bụ ụlọakwụkwọ Pramarị ma bụrụkwa ebe obibi. Ụmụakwụkwọ Ohen Nursery & Primary School so na ndị azọpụtara n'ebe ụlọelu dara na Legọs Ndị ọrụ gbagbata kwụsịburu ọrụ ịchọ ndị ụlọ dagidere ụbọchị Tọọzde. O nweghị onye ma mmadụ ole nọ n'ụlọ ahụ oge ọ dara mana obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma dịka gọọmenti kpebiri ịkwụsị ịchọ mmadụ ebe ahụ n'ihi na ọtụtụ ahụbeghị ndị nke ha. N'oge ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu n'ụtụtụ Tọọzde, Adesina Tiamiyu bụ onyeisi ngalaba gbatagbata nke Legos steeti nke a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ dụburu ndị nne na nna na-achọ nwa ha ọdụ ka ha ga n'ụlọọgwụ Island General Hospital iji nweta ozi maka onye ha na-achọ. Adesina Tiamiyu bụ onyeisi Lasema kkwuru na a gụkọcha beghị mmadụ ole nwụrụ n'ọdachi ụlọelu dara na Legọs ụbọchị Wenezde O kwuru na akụkọ na ụlọakwụkwọ ahụ o metụtara nwere ụmụaka ụmụakwụkwọ otu narị bụ ụgha. Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ. Ndị nne na nna jupụtata n'ụlọọgwu Ndị nne na nna wakporo ụlọọgwụ 'General Hospital, Marina, na legọs na ụlọọgwụ ndị ọzọ dị nso ịchọ ndị nke ha dịka akụkọ na o nwere ndị azọpụtaran'ụlọ dara na Legọs ụbọchị Wenezde. Oge BBC gara n'ụlọọgwụ ahụ, ọtụtụ ndị o metụtara jupụtara ma na-anata nleta n'ọnụmara dị iche iche dị n'ụlọgwụ ahụ. Onye nnukwu odeakwụkwọ Mịnịstry na-ahụ maka ahụike gwara Grace Ekpu nke BBC na a na-elezi ndị ahụ ka azọta ha ndụ tupu eziga ha n'ụlọgwụ ndị ọzọ. Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị ọdachi ụlọelu dara n'Ịta-Faajị metụtara okwu nkasiobi. N'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina kesara, o kwuru sị na ọ na-ewute ya nke ukwuu na ihe a metụtara ọkachasị ụmụaka. O kwuru sị na ọ na-ekpe ekpere ka Chineke gbaa ezinaụlọ ha ume, ma na-ekpe ekpere na ndị merụrụ ahụ ga-agbake n'oge na-adịghị anya. O kwekwara gọọmentị Legọs nkwa na gọọmentị etiti ga-enyere ha aka n'ụzọ ọbụla ha chọrọ. Buhari kwuru sị ""Ọ na-emetụta mmdụ ma mmadụ nwụọ n'ọdachi ọbụla, ọkachasị mgbe ọ bụ ndị ka bụ ụmụaka. Ka Chineke gbaa onye ọbụla ihe a metụtara ume."" Onye isi ndi ọrụ gbatagbata ebe ụlọelu a dara ada n'Ita Faaji na Legos sị na ụlọ ahụ nwere ogogo atọ. Mpaghara nke mbụ bụ ebe ndị na-ere ahịa nọ. Mpaghara nke abụọ bụ ebe ndị mmadụ bi, ebe mpaghara nke atọ bụ ebe ụmụakwụkwọ karịrị narị na ndị nkuzi ha nọ. Ndị ọrụ gbatagbata azọpụtala ihe karịrị ụmụaka anọ so na ndị tọrọ n'okpuru ụlọelu atọ dara na Legọs ebe mmadụ itoolu nwụrụ. Aka na-achịkọta Legọs bụ Akinwunmi Ambode gara ebe ahụ iji kasie ndị mmadụ obi, mana ndị mmadụ tụgharịrị na-atụ ya akpa mmiri. O kwuru okwu nkasiobi n'elu Twitter Anyị nụkwara na eburula ụfọdụ ndị azọpụtara gawa ụlọọgwụ Island Maternity dị nso n'ebe ahụ. Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ebe ihe mere na-ekwu na aha ụlọakwụkọ ahụ bụ 'Bardem' nke dị na Legọs Island. Onyeisi ndị gbatagbata e kwoula na ụmụakwụkwọ karịrị narị juru n'ime ụlọ ahụ tinyekwuru nwaanyị dị ime nakwa ndị nkuzi ha sochakwa na ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ. Ndị ọrụ nchekwa dị icheiche nọ ebe ahụ soro na-enye ndị ọrụ gbatagbata enyemaka. Ndị ọrụ gbatagbata kwaturu ụlọ ndị dị nso n'ebe ahụ iji chọta ohere ebe a ga-esi zọpụta ndị tọrọ ebe ahụ. Ihe mberede a mere n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde ka anyị nụrụ maka ihe mberede na ụlọ obibi nakwa ụlọakwụkwọ so n'ime ụlọ a dara na Legọs. Akụkọ kwukara na ụfọdụ ụmụaka ka tọrọ n'okpuru ya bụ ụlọ ebe ndịọrụ gbatagbata na-agbalị ịzọpụta ha. BBC Igbo ghọtara na o ruola afọ abụọ kemgbe gọọmentị na-achọ ịkwatu ụlọ a mana onye nwe ya ekweghi. Akụkọ ga-amasị gị ịkọ" 44432761,https://www.bbc.com/igbo/44432761,Lee ihe ụmụnwaanyị ji isiowu emezi,Ọ bụ eziokwu na ndị nne nne anyị ha n'oge gboo bụ naanị isiowu na isiaka a kpara akapa bụ ihe ha maara ha ji achọ mma.,"Ha na-eti isiowu n'ụzọ dị icheiche mana ọ gbanwere oge e bidoro ire ntutu ndị ọcha n'eyi. Ụmụnwaanyị hapụrụ isiowu e ji mara ndị Afrịka bido iti nke ndị ọcha, nke mere na n'afọ ole ole gara aga, nwaanyị a hụrụ ebe ọ kpara isiowu; a na-ele ya anya ka: Mana ugbua, ọ dịkwa ka o nwere ihe gbanwere. Ọ dịkwazi ka ụmụnwaanyị enwere ihe ha hụrụ na ya bụ ụdị isi. Mana o nwere ihe dị iche na etu e si eke ya mgbe ahụ na ugbua. Ugbua, ọ bụghịzị naanị owu eri ka e ji ekezi isiowu, a na-eji ma owu eri, ma owu rọba nakwa owu nke ndị Bekee a na-akpọ 'Brazillian Wool'. Ụmụnwaanyị na-eji agwa masịrị ha akpa isi owu, etu o si gụọ ha Oge mbụ, naanị agwa owu e nwere bụ ojii, mana ugbua, ụmụnwaanyị nwereike ịkpa isiowu jiri ụdị agwa ọbụla masịrị ha, etu o si gụọ ha. Nwata nwaanyị a jiri agwa mmemme kee isi nke ya Agbanyeghi ụdị ihe ọgbara ọhụrụ ụmụnwaanyị jizi eke isiowu, ha atụfụbeghi owu rọba na owu eri. Owu eri na-arịazi ahụ inweta n'ahịa ugbua. Ndị ụfọdụ na-eti owu Bekee, ụfọdụ ka na-etikwa nke rọba Ezinne Aninwe kwuru na agbanyeghi na isiowu na-adọtị ntutu, otu ihe ọọ mere ya ji akpa ya bụ na ọ dị ọnụ ala. O kwuru na ọ naghị emefu ego ka ụdị isi ndị si emefu. Onye ji naanị otu puku naịa nwereike ịkpa isi mara mma gụnyekwara akụrụngw ihe ndị ọ ga-etinye na ya, mana ike ụdị isi ndị ọzọ adịghị ọnụala etu ahụ. Ụfọdụ ụmụnwaanyị kwuru na ishiowu na-afụ ụfụ nke ukwuu mere na ha anaghị akpa ya ma ndị ọzọ ekwenyeghi na nke a. Isiowu anaghị akwụsị ụmụnwaanyị iti ụdị uwe ọbụla ha chọrọ, ha ji ya eti ma akwa ọdịnala ma nke bekee. Nwaanyị tiri uwe ọdịnala Nwaanyị a bụ Chinonso Onyia kwuru na ihe o ekere isiowu bụ ihe ndị a: 1. Isi owu na eto ntutu ofuma2. Ọ naghị afụ ụfụ 3. O nwere ụdị mma isi owu na ama4. Maka na abụ m ezigbo nwa Ada Igbo, ọ na-amasị m ike isiowu n'ihi na ọ bụ isi e ji mara ndị Igbo. Nwaanyị a ji ekike ndị ọgbara ọhụrụ tie isi owu nke ya Nwaanyị a tiri ishowu ma tee uri ọnụ etu nwa agbọghọ Igbo si eti mgbe gboo Ụmụnwaanyị ewechighala isiowu n'ụdị ọhụrụ Nwaanyị a ji ekike ndị bekee ji aga ọrụ wee tie ishiowu nke ya Otu ihe dị mkpa ịmata bụ na ndị na-eme isi ekwuola na isiowu na-enye aka ichekwa ụdị ntutu Chineke nyere ndị Afrịka site n'ihuigwe ha siri ike. Ha kwukwara na ọ na-enye aka eto ya bụ ntutu we hụụ na ọ gbatịrị nke ọma. Ezinne Aninwe kwuru na otu ihe ya ji eke isiowu oge ụfọdụ bụ maka na ọ na-enye aka gbatịa ntutu ya ma mee ka ijikọ ya dị mfe. Ụmụnwaanyị na-eti agbọghọ mgbe ochie kere isiowu nke ọma, o ga-abụ ya kpatara na ntutu ha toro eto nke ọma ma kwee ha nhazi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43396471,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43396471,Abuja - Ụlọikpe akwụsịla NASS ịhazigharị usoro ndọrọndọrọ ọchịchị,"Ụnyahụ bụ Wenezde, Nkwọ, ka ụlọikpe ukwu nọ n'Abụja kwụsịrị ndị omeiwu NASS ka ha aghara ịme ihe ọbụla maka ịmegharị iwu nke usoro ndọrọndọro ọchịchị na Naịjirịa bekee kpọrọ ""Electoral Act"".","Accord Party gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka NASS ghara ịmegharị usoro ejị eme ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa Cheta na Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari jụrụ na ya agaghị etinye aka na ya bụ akwụkwọ nke ndị ọgbakọ ọmeiwu wetere ya rụọ mgbe ụlọikpe ahụ kpebi ikpe maka akwụkwọ Accord Party gbara ha. Ọkaikpe ukwu na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Ahmed Mohammed gwara ndị ya bụ ikpe metụtara ka ha ghara ịtinye aka maọbụ mee ihe ọbụla na ya bụ okwu ""rụọ mgbe ụlọikpe ahụ yiri agba maka ya bụ ikpe"". Mohammed rụtụrụaka n'akwụkwọ ikpe obodo Naịjirịa, Isi nke isii 6 (6) nke 1999 Kọnstitushọn bụ ebe nyere ụlọikpe ikike ịkpụchị okwu ọbụla ewebetere na ya. Eyighariri ikpe ahụ ruo Tuzde, Orie 20 Maachị. Ụlọikpe ahụ sị na ha ma na ndị NASS nwere ike ịmalite ịmewe ebụm n'obị ha site na-ịdọrọ ike site na-ikike nke akwụkwọ iwụ bụ kọnstitụshọn, isi nke iri na asatọ amọokwụ nke ise 58 (5) nyere ha. Akwụkwọ iwu a nyere ndị NASS ikike ịkpọkọta ndị otu ha ruru okara abụọ n'ime atọ bụ ndị kwekọrịtara na ya bụ atụmatụ. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọjụjụ ọnyeisiala jụrụ na ya agaghị etinye aka n'akwụkwọ agaghị enwekwa isi. Ihe bidoro ikpe a bụ arịrịọ ọnụ efụ ndị otu Accord Party rịọrọ ụlọikpe sị ha ekwela ka ndị NASS mee uche ha na ya bụ okwu. N'aka nke ọzọ, ọkaikpe ndị NASS bụ Nwaada C.E. Ogbozor kwụrụ na udị arịrịọ a Acord party an-arịọ abụghị ihe ejị ọnụ efu arịọ. Na-ọbụrụ an ụlọikpe kweta ya na nke ahụ bụ ịnapụ ndị NASS ikike dịrị ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44569481,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44569481,Nwụchị Abaribe: Ihe otu Ipob kwuru maka nwụchị ya,Ndị otu IPOB etinyela ọnụ n'ihe gbasara nwụchi omeiwu Enyinnaya Abaribe.,"Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful kwuru sị na ọ bụ maka ihe gbasara IPOB ka e ji nwụchie ya, maka na gọọmentị etiti na-achọ 'ịgbọchi ndị Igbo ọnụ'. O kwuru sị tọghapụ ya ozugbo ozugbo. Ipob rịọrọ ndị gọọmentị mba ofesi ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka sị ha tinye ọnụ n'okwu a gbasara Abaribe na gọọmentị etiti. Ha kwukwara na onweghị ihe ga-eme ka ha kwụsị ọchịchọ Biafra. N'aka ọzọ, otu akpọrọ 'World Igbo congress' kpọkuru gọọmenti etiti ka ha tọghapụ Abaribe na-etinyeghị ọnọdụ ọbụla. N'akwụkwọ onyeisi otu ha bụ Anthony Ejiofor binyere aka, ha kwuru na ha hụtara nwụchi a dika ụzọ gọọmenti etiti si ekechi ndị na-akwadoghị ha ọnụ. Cheta na Ohaneze Ndigbo rịọrọ ndị okaikpe Naịjirịa ka ha ghara ime dịka ndị ""gọọmentị etiti Naịjiria na-eji aka ike na-emegbu ndị Igbo"" na Naịjirịa. Ohaneze Ndigbo n'ime akwụkwọ ozi a gbasara ndị ntakụkọ, kọwara na ha kwuru ihe a maka nwụchị ndị DSS nwụchịrị omeiwu na-anọchị anya Abia saụt bụ Eyinnaya Abaribe. Ha si na ha kwusiri ike n'ihe a mere makana ndị DSS na-achọ onyeisi ndị otu Biafra bụ Nnamdi Kanu bụ onye Abaribe gbaara akaebe. Cheta na ụnyaahụ, Ohaneze kwuru na Abaribe emeghi njọ ịgbara Kanu akaebe, nakwa na ọ bụ ndịagha Naịjirịa bụ ndị kwesiri ịchọpụta Kanu, na ọbụghị Abaribe. Onyeisi ndị otu a bụ Nnia Nwodo, kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na ọ dị mkpa ka onye ọbụla cheta na ọ bụ mwakpo ndịagha wakporo ụlọ Kanu n'Umuahia mere ka ọnọdụ Kanu jiri gbagwojuo anya. Nwodo gakwara n'ihu sị na ""ọ bụ sọọsọ ndị agha Naịjirịa nwere ị chọpụta ebe Kanu nọ ugbua. Makana ihe mere n'Umuahia ụbọchị ahụ bụ agha"" Nwodo kwukwara na ụbọchị a wakporo be Kanu, na o nwere ike ịbụ na ọ nwuru maọbụ na ọ nwụghị. Ohanaeze kwuru na ha na-arịọ ndị okaikpe ka ha kwụsị mmegbu ha na-emegbu ndị Igbo na kwa ka ha gba mgbo hu na a hapụrụ Abaribe kpam kpam. Ndị otu Biafra ahụbeghi onye isi ha Nnamdi Kanu ka mgbe Seputemba 2017 Cheta otu pati na-anọghi na ọchịchị nke a kpọro Peoples Democratic Party (PDP) na Bekee etinyere ọnụ na okwu nwụchị a ndị ngalaba nchekwa a kpọrọ DSS nwụchịrị onye na-anọchịte Abia Saụt na ụlọomeiwu ukwu. Site na ozi ha gbasara, ndị PDP kwuru na etu e siri nwụchie Abaribe dị ka etu e si anwụchi ndị echere na ha kpara mkpamkpa, bụ ihe ha che na ọ na-agba ama etu pati na-achi bụ All Progressives Congress (APC) siri chọọ ime ndị akwụnyeghị n'azụ ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 nke onyeisiala Muhammadu Buhari. Ha gakwara n'ihu kwuo na nwụchịkọ Abaribe bụ ụdịrị agwa Buhari n'ọchịchi ya chọrọ ịkpasị ndị ""nọ na ụlọomeiwu ọnụ ha na ada ụda, ọkachasi etu osiri metụta ebe o na ada iwu obodo"". Cheta na ndị DSS nwụchịrị Abaribe n'Abuja tata mana a mabeghị ihe ha jiri mee nke a. Cheta na Abaribe bụ onye kwụnyere Nnamdi Kanu dịka onye akaebe ị ji gbapụta ya n'ụlọịkpe Abaribe nọ n'ebe ọ na-akpụ isi n'Abuja mgbe ndị uweojii a pụrụiche nwụchiri ya. BBC Igbo na-agba mbọ ị nweta ụfọdụ ndị ụlọọrụ ndị uweojii pụrụ iche bụ DSS ị mata ihe ha ji nwụchie ya. Abaribe bụ Sinetọ na-anọchị anya Abịa-Saụt n'ụlọomeiwu kwuru n'ọnwa Eprelu na ndị ọchịehi na-achọ ị nara ụmụ Igbo ala ha Lee ihe onyonyo ebe o kwuru nke ahụ ebe a. Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ. Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-48328978,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48328978,Deontay Wilder akụpụtala kpakpando n'anya Breazeale,Deontay Wilder kụrụ Dominic Breazeale ihe tinka kụrụ pan n'agba nke mbụ n'ọkpọ ha kụrụ ma maburu iko WBC World heavyweight na New York.,"Wilder ji ọkpọ surie ogbo ya nke Amerịka n'ime agba nke mbụ, nke nyere ya mmeri iri anọ na otu na otu nhatanha n'ime asọmpi ọkpọ iri anọ na abụọ ọ kụrụla. Aka esichaghị Breazeale ike na mbido ọkpọ ahụ dịka Wilder kpagidere n'akụkọ ụdọ ma na-esu ya ọkpọ dịka ebe a na-asụ ede. N'ikpeazụ Wilder meriri n'ọkpọ ahụ dịka ọ ji otu ọnụ ọkpọ kunye Breazeale anya ajụ n'isi. Tupu ọkpọ ahụ Wilder kwuru na ọ chọrọ igbu mmadụ n'ọgbọ ọkpọ Dịka asọmpi ọkpọ a gụchara, Wilder kwuru ""Onweghi ụzọ ga-egbochi m"" ịkụso ndị ọkachasị na Briten bụ Tyson Fury na Anthony Joshua ọkpọ, O kwuru ""na ha nọ na mkparịtaụka"". Nke a bụ ugboro iri anọ Wilder na-eji ịkụnye ndị mmadụ isi aba okpu merie n'asọmpi ọkpọ, ebe ọ bụ ọdịda nke abụọ Breazeale na-enweta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45280095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45280095,Ekweremadu: Mee ọchịchị onyeisiala na gọvanọ otu ọnụ afọ isii,Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị kwenyere n'ihe Ike Ekweremadu kwuru ka oge ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ bụrụ otu agba afọ isii.,"Mee ọchịchị onyeisiala na gọvanọ otu agba afọ isii Ndị a gụnyere onyeisioche United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie na ọkaiwu Chukwuemeka eze. Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi ndị Sineti agbarụọla ihu n'ekpomaọkụ ndọrọndọrọ ọchịchị na-aga n'ihu na Naịjirịa ugbua. Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị Ọ gara n'ihu kwuo ka e mee oge ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ otu ọnụ afọ isii site n'ozi si n'akara Facebook ya. Ọ gakwara n'ihu taa ọchịchị onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na ndị ọrụ ụta n'ịkwanye ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa iji hụ na ha lọghachịrị n'ọchịchị n'afọ 2019. N'okwu ya ""Ọ dị mwute na ekpomaọkụ ndọrọndọrọ ọchịchị tinyere imebiga ihe ike oke dị ugbua na Naịjirịa agaghị akwụsị rue mgbe ntuliaka afọ 2019 gafechara."" ""Enweghị ike ịgbanarị ọnwụnwa dị n'ikike ọchịchị, ndị ọnụ na-eru n'okwu na-eme ihe niile ha nwere ike, iji ejigide ọchịchị."" "" E kwesiri m ike n'otu ọnụ afọ ise maọbụ isii n'ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ ma ntuliaka afọ 2019 gacha, dịka e si eme ya n'ọchịchị onye kwuo uche ya nke mba Latin Amerịka dị icheiche."" Ekweremadu kwuru na nke a ga-enye aka ibelata oke ekpomaọkụ dị na ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa na-emebiga ihe oke ndị ọchịchị dị n'etiti. Ihe ndị ọnụ na-erụ okwu kwuru Okorie bụ onye kwuru na ọ bụ Alex Ekwueme bụbu osote onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga wepụtara ọ dị n'aka Ike Ekweremadu na ndị omeiwu ọzọ ime ka atụmatụ a baa n'iwe na-achị Naịjirịa. Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ ọkaiwu Chukwuemeka Eze, o kwuru na atụmatụ a dị mma n'ihi na ndị ọchịchị na-achị naanị afọ abụọ were ndị ọzọ mee ndọrọndọrọ ọchịchị ịpụta ọzọ. Eze kwuru na ọ ga-adị mma ka ọ bụrụ naanị ọtụ agba afọ isii, ka amaara onye rụrụ na onye na-arụghị ọrụ. Cheta Ike Ekweremadu ekwupụtabuola atụmatụ n'oge mbụ n'otu ọgbakọ ndị Sineti mere. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55157145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55157145,International Slavery Abolition Day: Etu ịtụ mgbere ohu siri kwụsị n' Afrịka,"Taa n'ụwa gba gburugburu ka a na-eme emume ncheta nkwụsị ịgba ohu, iji cheta arụ akpaara oge gboo ma kwuo ọzọ emela n'ihe gbasara mgbere ohu.","Ndị mere ejije iji gosipụta ịgba ohu Igbo na-atụ n'ilu sị, 'onye amaghị ebe mmiri nọrọ mawa ya agaghị ama ebe ọ kwụsịrị'. Ndị ma ihe ekwe na-akụ n' ihe gbasara ndekọ ihe mere oge gboo na- ekwu na ọ bụ n' afọ 1544 ka a malitere bufewa ndị isiojii Afrịka ofe mmiri okeosimiri 'Atlantic' dika ohu ndịọcha. Ihe dịka agbata nde mmadụ iri na nde iri na abụọ bụ ndị a gbara na mgbere ohu site n' Afrịka gafee oké osimiri Atlanti bụga ha Yorup na Amerika ebe e ji ha mere ndị ọrụ n'ụgbọ shuga na kọfị na mba ndị ahụ bido n'afọ 1700 rue 1900. N'otu oge ahụ, ihe karịrị ụmụ afọ Igbo mmadụ otu nde na ụma ise so na ndị e refuru ala ndịọcha. Dịka akwụkwọ 'Britannica' siri kọwaa ya, ndị a bụ ndị e jiri gbanwere akwa mmanya na ngwaọgụ ndịọcha na-arụpụta oge ahụ. Etu e siri bido agha ịmachi mgbere ohu Ihe akpụrakpụ na-egosipụta nnwereonwe ndị ohu Obere mba ndị ọcha ndị ọzọ dịka Spen, Brazil,Portugal mechara machie mgbere ohu na mpaghara nke ha n'agbata 1860. Slave Trade: Ihe ọkpụ fọrọ maka ịgba ohu n'ala Igbo Mana iwu ndị a mba dị icheiche mapụtara akwụsịghị mgbere ohu kpam kpam n'ihi na ya bụ ahịa bụ e zuo ka aha eri udele, a tọtuo ngịga. Ya bụ mgbere mmadụ bụ nkata a dị ọtụtụ akpa site na mba gafere na mba ọzọ. Nke a pụtara na mkpebi ịkwụsị ya zụrụ oke naanị mgbe e nwere nkwekọrịta mba na mba na ha ga-efopụ ajọ ero ahụ. Akpụrụakpụ ndị e jidere dịka ohu n'oge gboo Dịka ndị okwu a doro anya siri kwuo, ọ bụ mgbanwe echiche, obi Chineke nakwa ihe gbasara ndakpọ akụnaụba nke ụgbọ e ji ebu ndị ohu mere ka okwu ịkwụsị mgbere ohu ji nwee ezi isi. Nke kachasị nke bụ ozioma banyere ikike dịrị onye nke ụfọdụ ndị mmadụ welitere isi bidoro ịgbasa iji katọọ mgbere ohu. Ozi ahụ metụtara ọtụtị n' obi ma mee ka ọtụtụ sonye n' ọgụ "" nwere onwe ahụ. Tupu ihe ndị a e mee, e nwelarịị ọtụtụ ndị ohu nupụrụ isi na mba Haiti nakwa mba Amerika ebe ihe rụrụ mmadụ 300 haara mmiri ịgbagbu ha kama ha ga-abụ ndị ohu. A na-akpọ ebe ahụ taa dịka ""Igbo Landing"". Ndị a ma ama kachasị tinye Ụchụ n'ozioma ka a kwụsị mgbere ohu gụnyere: 1. Olauda Equiano(1745 - 1797) Olaudah Equiano, Olaudah Equiano bụ nwa afọ Igbo a tọọrọ ya na nwanne ya nwaanyị oge ọ dị afọ iri na otu, ree ha n'ohu buga ha ala Bekee. Ọ nọrọ ebe ọ bụ ohu mụta akwụkwọ ma rutakwa ego o jiri gbara isi onwe. Equaino so n'otu ndị isiojii mmadụ iri na abụọ soro gbaa mbọ maka nkwụsị mgbere ohu n'ihe dịka afọ 1786. O mechara dee akwụkwọ maka ije ụwa ya. 2. William Wilberforce(1759 - 1833) William Wilberforce William Wilberforce bụ onye mba Briten ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba ahụ. A mụrụ ya n'ikpo ego mana ọnọdụ ahụhụ ndị a gbatara n'ohu na-eri ya nri n'afọ nke ukwuu. Onye omeiwu bido n' afọ 1784-1812, Wilberforce iji ọkwa ya nakwa ihe ọ nwere tinye nnukwu uchu n'ịkwụsị mgbere ohu na mba Briten. 3. William Lloyd Garrison William Lloyd Garrison Na mba Amerịka ka okwu ịkwụsị mgbere ohu malitechara, e bidoro zilawa ụfọdụ ndị eri uru n'ohu Afrịka. Ihe dịka mmadụ 12000 nụ ihe a kpọlatara. Mana nzọpụ ụkwụ ahụ ezughị oke dịka mgbere ahụ na mmegbu ndị ohu na-aga n'ihu. Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko Garrison ji akwụkwọ akụkọ ọ na-ede were gbasaa ozi ka akwụ ya bụ ajọ ihe na mba Amerịka. E mechara pịachie akwụkwọ banyere ịgba ohu oge gboo. Mana arịrị na-eri obi ụfọdụ dịka otu ndị ọrụ mba ụwa bụ 'International Labour Organization' (ILO) n'ihi na ụfọdụ ndị mmadụ alọghachila n'agwa ọjọọ ahụ e kpochapụrụ afọ kwuru afọ gara aga. Dịka ILO siri gbaa n'ama, mmadụ karịrị nde narị anọ nọ n'ohu nke agba ọhụrụ dika a gbara ha na mgbere maọbụ manye ha ọrụ n'ụlọ ha anabataghị. N'afọ 2018, otu African Union kwuru na ihe ruru mmadụ dị n'agbata 400,000 na 700,000 bụ ndị na-agbaga ala Bekee bụ ndị tọrọ na ebe anwụchiri ha dịka ohu na mba Libya.Ụfọdụ n'ime ndị a n'anwụfu n'elu oke osimmiri 'Mediterran, ebe a na-erefu ụfọdụ were ha mere ohu n'ọnọdụ na-gbawa obi. Ihe nkiri ga-amasị gị: Ned Nwoko: Etu m siri kpata ego m" afirika-53203336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53203336,MyMTNApp: Enweela nkwekọrịta itinye akụkọ BBC n'ime ya,BBC na MTN nke Naịjirịa amalitela mmekọ ga-enye ndị nwere akara ekwentị MTN ohere ịnụ akụkọ ụwa si na BBC n'otu nkeji.,"Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ụwa ga-eru ndị mmadụ aka n'efu ma dịrị n'asụsụ Igbo, Awụsa, Pidgin nakwa Yoruba. Ihe a bụ mbụ ụlọ ntaakụkọ gazuru ofesi ga-apụta n'ogige akụrụmgwa akpọrọ MyMTN. BBC Minute bụ atụmatụ ịkọ akụkọ dị mkpa n'ime otu nkeji, nke BBC ji eme ka ndị na-ege ha nọ ebe dị iche iche mara ihe na-eme. Nkeji BBC a na-enwe akụkọ na-ewu na soshal midia na akụkọ na-eme n'ụwa dum ma na-agbanwekwa ya ugboro ugboro n'otu ụbọchị. Atụmatụ a bụ maka ndị nọ na Naịjirịa. Ọ ga-erere ndị Awụsa, Igbo, Pidgin na ndị Yoruba chọrọ akụkọ na nkenke, ma wetere ndị Naịjirịa chọrọ akụkọ BBC na nkeji n'ekwentị ha. Dịka akụkọ ụgha na-abawanye n'ogige ntaakụkọ Naịjirịa nakwa Afrịka, nkwekọrịta a ga-enye ndị nwere akara ekwentị MTN ohere inwete akụkọ kwụ ọtọ n'aka BBC. MTN bụ ụlọọrụ mgbasozi ekwentị kachasị n'Afrịka, nke na-enyere ihe karịrị mmadụ nde 64 aka inwe mmekọrịta dị iche iche site n'ekwentị ha. myMTN nwere ihe karịrị mmadụ nde anọ na-abata ya kwa ọnwa. Oluwatoyosi Ogunseye, bụ onyeisi BBC n'Ọdịdị-Anyanwụ Afrịka sị: ""Nkwekọrịta anyị na MTN na-eme gosiri etu BBC si na-agba mbọ iru ọha na-ege ntị ebe ọbụla ha nọ. Anyị na-enwekwa aṅụrị maka ohere anyị na ndị ntoroọbịa na Naịjirịa nwere inwe mmekọrịta."" Lekwa ndị mgbasa ozi BBC Igbo Onye ọzọ kwuru okwu bụ onye ji ọkwa Bekee kpọrọ ""Chief Digital Officer"" na MTN Naịjirịa bụ Srinivas Rao. Ọ sị ""Nkwekọrịta a masiri anyị nke ukwuu. Ọ bụ otu ụzọ anyị si enye ntoroọbịa Naịjirịa ohere inwete ozi nwere isi. N'oge ugbua akụkọ ụgha na-agbasa aghara aghara site na soshal midia, ọba dịka nke a ga-abụ ihe ọpụrụiche."" Kolawole Oyeyemi, bụ onye ji ọkwa Bekee kpọrọ ""General Manager, Customer Experience"", na MTN sị: ""Ọ ga-egosikwa mmasị anyị n'inye ndị na-azụ anyị ahịa ihe ọkamma site na myMTNApp. Ha ga-esi ebe a nwete akụkọ eziokwu n'efu."" Mary Lusiba, ji ọkwa Bekee kpọrọ ""Head of African Business Development na BBC World sị: ""Ọmarịcha nkwekọrịta a ga-eme ka ndị mmadụ mata maka anyị na ihe anyị na-eme, ọkachasị ndị ntoroọbịa. Ọ ga-esonye aha ọma BBC nwere n'inye akụkọ ọpụrụiche were ruo ndị ntoroọbịa ọhụrụ. Nkwekọrịta a ga-enye aka gbasaa ozi banyere ọrịa covid-19 n'Afrịka.""" afirika-49328872,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49328872,Joe Igbokwe sị na onye kwuru na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si ọkụ ala mmụọ,Ndị Naịjirịa kpụ Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru APC n'ọnụ n'ihi ihe o kwuru banyere onyeisiala Muhammadu Buhari.,"Joe Igbokwe nọrọ na mkpatrịtaụka ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ 'Channels TV', kwuo na ""Onye ọbụla sị na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si n'ọkụ ala mmụọ"". Nke a bụ na nzaghachi okwu Ken Okolugbo bụ onye PDP kwuru na gọọmentị Buhari anaghị eleta ndị Naịjirịa anya nke ọma dịka o kwesiri. Ihe a abụghị nke mbụ ọ na-ekwu ụdị okwu a, cheta na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'afọ 2018, o kwuru na ndị Igbo amaghị ndọrọndọ ọchịchịe Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe A bịa n'okwu 'Restructuring' na Naịjirịa, Joe Igbokwe sị ndị Igbo, ndị Hausa na ndị Yoruba ga na-esusu ọnụ. Restructuring: ""Anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ"" - Joe Igbokwe N'afọ 2019 mgbe Ohanaeze Ndigbo kwadoro Atiku Abubakar ịzọ ọkwa onyeisiala, Igbokwe sị na Nnia Nwodo bụ onyeisi ha naara Atiku aka azụ. Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu Mgbe onye bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo degaara onyeisiala Buhari 'letter', Joe Igbo sị na Obasanjo na-akọgheri akọgheri. Igbokwe: Obasanjo na-akọgheri akogheri Ọ bụghị ihe ịtụnnaya na Joe Igbokwe na-akwado onyeisiala Buhari n'okwu ya niile n'ihi na ọ bụ onye pati APC ma bụrụkwa ọnụ na-ekwuru APC na Legọs Steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51665153,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665153,Covid-19: Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ ebutela Coronavirus,Otu nwaafọ Naijirịa aha ya bụ King Paul Akpan Udoh ebutela ọrịa CoronaVirus.,"Udoh na-agbara ndị otu Pianese na 'Serie C' ndị mba Itali. Dịka ọ dị ụgbụa, ewepụla ya si n'ebe ọha nọ pụọ nke bekee na-akpọ ""Quarantine"". Akụkọ na-ekwu na enwere mgbe ndị otu Juventus Chọburu ịgote ya mana ọnweghị isi. Ndị egwuregwu bọọlụ na-atụ ụjọ na enwere ike ị sị ha sọo asọmpị n'ebe ha nwereike ibute oria a. Mana ka ọ dị ụgbụa, eyiharịala ụfọdụ asọmpị nke dịka AFC Champions league maka ọrịa Coronavirus. Onyeisi ndị ụka Katọlik na Legọs bụ Adewale Martins amachiela inyerịta ekele nke udo n'oge mass. Nke a bụ otu ụzọ iji kee nkwụcha ma belata mgbasa ọrịa coronavirus. Bishọp Adewale Martins kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ na mgbede Fraịde. Chetakwa na a kwụsịkwara inye ekele nke udo oge ọrịa Ebola malitere n'afọ 2014. Oge ekele nke udo bụ oge ndị mmadụ ji ekelekọrịta ibe ha n'oge a na-aka ụka. A na-eme ya iji gosi ihụnanya na ịdịkọn'otu n'etiti ndị otu Kristi. Achbishọp Adewale Martins Bishọp Martins kwukwara na ọgbakọ ngagharị nke obe (stations of the cross) bụ nke ndị Katọlik na-eme ụbọchị abụọ n'izuụka ọbụla, ga-abụzị sọ otu ụbọchị. A na-emekarị ngagharị nke obe kwa Wenezde na Fraide ọbụla n'oge lent, ugbua, ọ ga-abụzị sọ n'ụbọchị Fraide. Arsenal alaala Ndị Arsenal ebejuola efere n'akwa dịka ndị Olympiakos ji nke a kpọrọ 'away goal rule' gbapụ ha n'asọmpi Europa League n'abalị. N'agbanyeghi otu goolu o nyere na nkeji 113, Pierre-Emerick Aubameyang bụ onyendu ha riwara agba dịka nkeji e ji egbuchi bọọlụ ruru, nke kpọnyere ntu n'akpati e ji bupu ha na ya bụ asọmpi. Ndị Olympiakos na onwe ha si n'aka Pape Abou Cisse na Youssef El Arabi nye goolu abụọ so mee ka mmeri ha zuo oke. Cheta na Arsenal jibu naanị otu goolu merie ha n'ụlọ ha mgbe ha zuteburu. Ka ọ dị ugbua, olileanya Arsenal nweburu isi ụzọ a mara ma ha a ga-enweta ohere ịbanye na Champions League nke afọ 2020/21, enweghizi isi. Chetakwa na ha ruru n'agba ngwụcha n'asọmpi a n'afọ gara aga, mana Chelsea sepụrụ ha ara n'ọnụ iji bulie iko a. N'otu aka ahụ, Odion Ighalo bụ nwaafọ Naịjirịa nyere goolu mbụ ya dịka onye Man United, ka ha ji ọkpụ goolu ise asaghị asa sụjuo Club Brugges afọ. Coronavirus nọ na Naịjiria Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjiria agwala ọha okwu, ebe ọ na-asị ndị mmadụ dere jụụ n'ihe gbasara mbata ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Ọ gara n'ihu sị na ha ekeela nkwụcha n'ihe gbasara ibuso ọrịa a agha, mana gwa ndị mmadụ ka ha na-edebe onwe ha na gburugburu ha ọcha. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: Gọọmenti Nigeria ekwuola okwu maka Coronavirus Ihe onyeisiala Saụt Afrịka na-eme maka Coronavirus Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka enyela iwu ka a kpọlata ihe ruru mmadụ otu narị na iri atọ bụ ndị mba ha bi n'obodo Wuhan dị na Chaịna bụ ebe ọrịa coronavirus a na-enye ụwa nsogbu malitere. Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ bụ ndị mba Saụt Afrịka na-arụ n'elu ụgbọmmiri e jidere mmaka nnyocha ọrịa a na mba Japan, eburula ya bụ ọrịa. Etu coronavirus si metụta ahịa mbaụwa Ahịa mba Briten Ụlọahịa ndị achụmntaego nke a kpọrọ stock market na Bekee na ha akpụ afọ n'ala na mpaghara mbaụwa gụnyere Ọstrelia, Briten, Jamini, Frans nakwa mba Amerịka. Ọ kacha mpaghara Eshia dịka Japan, India, Hong Kong, Shanghai dị na Chaịna nakwa Seoul dị na mba Saụt Koriya. Ahịa mba Japan N'egwuregwu, A ga-ama ma nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi ọ ga-eso ndị Leicester City gbaa bọọlụ taa dịka ha ga-ezute ndị Norwich taa. Cheta na a wara ya ikpere ka ọ merụchara ahụ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 52375564,https://www.bbc.com/igbo/52375564,Coronavirus Tips: Igwe ahụ ọkụ ọ na-egosi onye nwere ọrịa coronavirus?,Otu n'ime njirimara ọrịa coronavirus bụ ahụọkụ.,"Nke a mere na tupu mmadụ abanye ebe ọbụla ugbua, a ga-eji igwe nke Bekee kpọrọ 'thermal scanner' wee mara ma ahụ onye ahụ ọ dị ọkụ karịa etu o kwesịrị ịdị. Mana ọbụghị igwe ahụ ga-ekwu ma onye ahụ enwere ọrịa coronavirus ma o nweghi. Cheta na ha dị ọtụtụ ọrịa nwere ike ime ka ahụ mmadụ dị ọkụ karịa etu o si adịbu. Ọzọkwa bụ na mmadụ nwere ike inwe nje coronavirus mana ahụ ya adịbeghị ọkụ, nke pụtara na onye ahụ nwere ike ibufe ndị ọzọ ya bụ ọrịa." media-44942972,https://www.bbc.com/igbo/media-44942972,Ndịọrụ Fidelity Bank : Ihe mere anyị jiri mee ngagharịiwe,"Ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere ngagharịiwe ụbọchị Tuzde n'isi ụlọọrụ ụlọakụ ahụ dị na Kofo Abayomi nakwa ụlọakụ ha dị n' Ahmadu Bello Way na Victoria Island, Legos.","Lee ngagharịiwe ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere maka ụgwọ e ji ha Na ngagharịiwe a nke yiri nke ha otu izuụka gara aga, ha boro ebubo na ụlọakụ ahụ akwụghị ha ụgwọ ọnwa iri nakwa ụgwọ a na-akwụ onye si n'ụlọọrụ ahụ apụ nke a na-akpọ 'severance package' na Bekee. Ndị ọrụ ahụ ndị ọtụtụ bụcha ndị obere ọkwa ruru iri atọ na-agụ egwu e ji mara ndị ọrụ iji gosi iwe ha. Ha bukwa akwụkwọ na-egosi iwe ha na-ekwu; 'Kwụọ anyị ụgwọ ịgbara ụlọakụ a odibo afọ iri na isii' 'Kwụọ anyị oke ruru anyị', 'Fidelity Bank, anyị rụtara ego a', 'obi ọjọọ a akarịala.' Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC na ụfọdụ n'ime ha nwere, ha boro Fidelity bank ebubonja ha jụrụ ịkwụ ha ụgwọọnwa ọnwa iri nakwa ụgwọ a na-akwụ onye na-apụ apụ. Innocent Eluwa onye kwuru na ya rụọlọra Fidelity Bank ọrụ afọ 12 boro ebubo na ụlọakụ ahụ wetara atụmatụ ịchụ ha niile na akwụghị ụgwọ. Mana ka ha mechara ngagharịiwe, ""Ndị ụlọakụ ahụ kwetara ịkwụ N100,000 maka otu afọ n'ime afọ ole onye ọbụla rụrụ ha ọrụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na Fidelity kwụrụ ụfọdụ ma hapụ ụfọdụ ndị ọ na-ekwụ bụkarịrị ndị so na ngaghariwe ha meburu na mbụ. Ndukwe Samson kwuru na ya so na ndị si Manny Bank banye Fidelity oge e jikọrọ ụlọakụ ahụ ọnụ. Samson sị na ihe ha chọrọ bụ ka: ""Ha kwụọ anyị ụgwọ ọnwa ọnwa iri ha ji anyị, nyekwa anyị oke ruru anyị nke bụ N100,000 maka otu afọ n'ime afọ ole onye ọbụla rụrụ ha ọrụ."" N'okwu ya, onyeisi ndị uwe ojii mpaghara ahụ kelere ha maka ịkwanyere onwe ha ugwu ghara imebi ihe oge ha na-eme ngaghari iwe. Mana ndị na-ekwuchitere ụlọakụ ahụ bụ Charles Aigbe na Ejike Ndiulo gwara BBC na ndị ahụ na-eme ngaghariwe abụghị ndị ọrụ ha kama ha bụ ndị na-arụrụ ụlọọrụ anyị na ha na-arụkọ (outsource company). Aigbe bụ onyeisi ngalaba mgbasaozi n'ụlọakụ sịrị; ""Ndị ọrụ a ị na-ahụ abụghị ndị ọrụ Fidelity Bank. Ebubo ha achịtaghị aja. Ha bụ ndị ọrụ ụlọọrụ na-arụbụrụ Fidelity Bank ọrụ. Ha bụ ndị ọkwọụgbọala na-arụburu ụlọọrụ ha ọrụ."" N'otu olu ahụ, Ndịụlọ kwukwara na ndị mere ngagharịiwe ahụ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ndị ụlọọrụ ha na ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ. ""Ha abụghị ndị ọrụ anyị. (Egwu iji gosi iwe...) Ngagharịiwe ndị ọrụ Fidelity ị hụrụ bụ maka na ụlọakụ wetara atụmatụ ọhụrụ nke adịghị mma nke kwuru ka achụ ndị ọrụ niile ma n'Abụja ma na Pọtakọt n'ebe niile were mee ngagharịiwe. Ndị isi ụlọakụ were zukọọ kwekọta na ha ga-akwụ onye ọbụla potu narị puku naira n'otu afọ gbakọta afọ ole onye rụrụ ọrụ n'ụlọakụ ahụ. Otu onyeisi a na-akpọ Madam Chijioke Okechukwu nwere kpọọ anyị gwaa anyị ihe ekwekọrita. ""Ndị a abụghị ndị ọrụ ụlọakụ Fidelity. Ọ bụghị Fidelity were ha n'ọrụ. ""Ị bia n'ụlọakụ Fidelity, anyị nwere ndị na-azara anyị ihe, ndị na-ekpocha ahịhia. Ndị a bụ 'vendors' ka a na-akpọ ha na bekee. O nwere ụlọọrụ kpọtara anyị ndị na-anyara anyị ụgbọala. ""Oge ụlọakụ Fidelity kwuru na anyị achọzighịkwa ndị ọkwọụgbọala, anyi sị ha lọchaghịkwa ụlọọrụ nwe ha. Ọ gwụla. ""Ụlọakụ Fidelity bụ ezigbo ụlọọrụ n'ala Naijiria. Onye ọbụla bụ onye ọrụ anyị pụọ n'ụlọakụ Fidelity, a ga-enye ya oke zuru ya, ya ewere lawa.""" 52759267,https://www.bbc.com/igbo/52759267,Anambra steeti: 'Nọọsụ eboro ebubo izu nwa n'Anambra steeti ezughi nwa' - Ndị uweojii,Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gbasara nọọsụ ku nwaọhụrụ ndị mmadụ gbara okirikiri ezughi nwa ahụ ezu.,"Ihe mere na ya bụ ihe onyonyo gosiri na a na-ebo ya bụ nọọsụ ebubo izuru ya bụ nwaọhụrụ n'ụlọọgwụ ha dị n'Okpoko n'ime Ọnịcha. Akụkọ kọrọ na ya bụ nọọsụ ku ya bụ nwa kwuru n'akụkụ ụzọ, ebe ndị mmadụ malitere inyo ya enyo, na-agba ya ajụjụ ebe nne nwa o ku n'ahụ nọ, ma jụ na ọ gaghị eku nwa ahụ pụọ. Ha malitere ịmanye ya ka ọ gaa kpọta nne ya bụ nwa tupu ha ahapụ ya. Mgbe BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, ọ zara na ya bụ akụkọ ezughị oke. Ọ sị na a mụrụ ya bụ nwa na-akaghị aka n'ụlọọgwụ ebe nọọọsụ ahụ na-arụ ọrụ bụ Mother of Mercy, n'Okpoko, Ọnịcha, nke mere dọkịnta ụlọọgwụ ahụ ji si nọsụ ahụ na nna ya bụ nwa ha kpọrọ ya gaa tinye ya na ""incubator"" n'ụlọọgwụ ọzọ. Mgbe ha na-agazị ebe ahụ ka ndị mmadụ gbakọzịrị bowe ya ebubo a ka ha hụrụ ya ebe o ku nwa a na-ehichabeghi ahụ n'ụzọ. Harụna sị na ọ bụghị eziokwu na ya bụ nọọsụ zuru nwa ahụ ezu. Lee ihe nkiri butere okwu a ebe a dịka Linda Ikeji Blog si tinye ya: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46036069,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46036069,Shiites: Kedu ebe ndị uweojii kpọchịrị mmadụ 400 ha nwụchịri?,"N'ime akwụkwọ ozi nke Jimoh Moshood bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii binyere aka na ya, anwụchiela mmadụ 400.","O kwukwara na anwụchiri ha n'ihi nsogbu ha na-enye ọha mmadụ nakwa ngwa ọkụ ha gbara ụgbọala ndị uweojii. ""Ndị uweojii agaghị agba nkịtị ka ụfọdụ ndị mmadụ jiri iwu ala mee akaja"" bụ ihe ọzọ pụtara n'ime akwụkwọ ozi ahụ. Ọzọ bụ na ""onyeisi ndịuweojii akatọọla atụmatụ ndị ahụ"" ma jiri ohere a na-agwa steeti ndị gbara Abuja gburugburu ha kee nkwụcha. Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki katọọ ihe ọ kpọrọ mmefu ndụ ndị mmadụ site n'akara Twitter ya N'azụ ọgbaghara dara n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị ofufe alakọba akpọrọ Shia ụnyaahụ, ndị mmadụ gbara ọsọ ụkwụ erughi ala n'ehihie taa. Ụda egbe bidoro dawa na gburugburu Wuse 2, bụ obodo dị n'ime Abuja. Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri ka ụda egbe na-arị ibe ya elu n'ebe asị bụ Wuse ahụ. Otu n'ime ihe nkiri a gosiri ndị dịka ha abu ndị Shia na-eme ngagharịiwe maka onyeisi ha bụ Ibrahim Elzakzaky aka ji kemgbe afọ abụọ, agbanyeghi na ụlọ ikpe sị ka atụhapụ ya. Onye tinyere ihe nkiri a bụ onye nwe akara Twitter @Clinton_Vice_B. Nyere ndị mmadu ndụmọdụ ka ha hapu ịga Wuse 2. Amara Nwankpa, bụ onye ama ama na Twitter, dere na ụzọ gbachiri na Wuse 2, ebe ụgbọala uweojii na-enwu ọkụ ka ndị Shia na-eme ngagharịiwe. Efe Tobo Oghozor tinyere kwara ọnu n'ihe na-eme ebe ahụ. Ngalaba na-ahụ maka ikike dịri onye bụ Amnesty International wepụtakwara ihe ha sị gosiri etụ ngagharịiwe ndị Shia, bụ ndị eji Islamic Movement of Nigeria (IMN) mara na-eme. Onye were akara @Ajikeade20 tinyere ihe nkiri gosiri ka ndị a na-eche na ha bụ ndị Shia na ndị uweoji na ama aka. @Gracemama1 tinyere ihe nkiri gosiri ụgbọala uweojii na-enwu okụ. Akara Twitter ndi Shia tinyere foto ha na-egosi ndi otu ha mgbo tụrụ na Wuse 2. Akụkọ ga-amasi gi" egwuregwu-49078475,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49078475,Barcelona vs Chelsea: Akọọla Barcelona ka ncha nkọta,"Ndị Chelsea tiri Barcelona mmọnwụ ka ha na Barcelona zutere n'egwuregwu enyi na enyi ha gbara taa bụ Tuzde, ụbọchị 23 nke ọnwa Julai, 2019.","Goolu abụọ Tammy Abraham na Ross Barkley nyere zuru inye ha mmeri, n'agbanyeghi na Ivan Rakitic mechara sata otu. Abraham bụ nwaafọ Naịjirịa e binyeburu ndị Derby County (bụ ebe onye nchịkọta Frank Lampard si gafete Chelsea) bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 34. Barkley tụkwasịrị ọzọ na nkeji 81, iji gosi Barcelona na ha ga-emerinwu ha n'agbanyeghi na onye egwu ha bụ Lionel Messi esoghi gbaa. Rakitic nyere nke ya na nkeji 90, mgbe anọzị n'egwu ụla, ka e mechara tinykwuoro ha nkji abụọ. Ha zutere n'asọmpi akpọrọ Iko Rakuten, nke ndị mba Japan ebe ụlọọrụ Rakuten dị hibere maka ịgba bọọlụ ndị enyi na enyi tupu afọ egwuregwu bọọlụ ebido n'ike na ebube. Chelsea zọrọ Barcelona ojukwu n'agbanyeghi na ndị ọhụrụ Barcelona zụtara dịka Antoine Griezmann, Pulisic na ndị ọzọ so gbaa. Egwuregwu a wetara ""pre season"" bụ egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke Chelsea n'isi njedebe Dịka ndị klọb niile na-ahọpụta mba ha ga-anọ agba asọmpi nke ha kwa afọ, Chelsea họpụtara mba Japan iji eme nke afọ a. Lee ihe Chelsea dere n'elu Twitter ha: Lekwa ihe nke Barcelona dere na nke ha: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" afirika-51485691,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51485691,Burna Boy ọ bụ ọkachamara ịgụ egwu na Naịjirịa?,"A bịa na ndị na-eti egwu na Naịjirịa ugbua, onye aha ya na-ada ụda karịsịa bụ Burna Boy.","Dịka ọ ka sị na njem isonye ndị a hopụtara maka nturugo 'Grammy' lọta, Burna Boy kwuru na ọ bụ ya bụ ọkachamara ikụ egwu kemgbe Fela Kuti. Ọ bụ n'akara Twitter ya ka o dere ihe a: End of Twitter post, 1 Ka ude ihe o kwuru ka na abawanye, Burna Boy kwukwara na onweghi onye ziri ya ụzọ n'itiegwu. Dịka a ma na ọ ga-eme, okwu ya nwuru ọkụ na Twitter ebe ọtụtụ mmadụ foro ntụtụ taa na nwaamadị ahụ tara anụ karịrị ọnụ ya. Mana, n'ime okwu a, onwekara ndị si na Burna Boy tozuru aha ọ chọrọ ka a na-etu ya. Onye bụ Burna Boy? Ọ bụ n'afọ 1991 ka a mụrụ Damini Ebunoluwa Ogulu e ji Burna Boy mara na Pọt Hacọt dị na River steeti. Nna ochie Burna Boy bụ Benson Idonije bụbụ onye na-ahịrị otiegwu Fela Kuti ihe. Ọ bụ n'afọ 2012 ka egwu Burna Boy tiri akpọrọ Like to Party wuru ọfụma were mee ka ndị mmadụ mata ya ọfụma. N'oge ahụ, ọ bụ ụlọ ọrụ egwu Aristokrat Records ka Burna Boy na-agụ egwu n'ogige ha. N'afọ 2017 Burna Boy wetere ohere isonye ụlọ ọrụ egwu na mba Amerịka akpọrọ Bad Habit/Atlantic Records nakwa Wrner Music Group - bụ ndi ga-elekọta anya ya na mba ụwa niile. Gịnị jikọrọ ya na Fela? Nna ochie Burna boy na Fela rụkọrọ ọrụ Dịka anyị kwuru mbụ, nna ochie ya na Fela rụkọrọ ọrụ Ọtụtụ egwu Burna Boy bụkwa nkụgharị maọbụ nwere atumatụ egwu Fela kụrụ mbụ. N'afọ 2013, n'oge Burna Boy ka na-aligote n'iti egwu Naịjirịa, ọ gara emume ncheta Fela akpọrọ Felabration mee ihe tụrụ ndị mmadu na-anya site n'iyi ibante guo egwu dịka Fela. N'oge ahụ, nwa Fela bụ Seun Kuti gbarụru ihu maka ihe Burna Boy mere site n'ikwu na ọbụghi etu a ka nna ya si agụ egwu. Ọ bụ ya kacha mara agụ egwu na Naịjirịa? Ụfọdụ na-ekwu na Wizkid ka mara eti egwu karịa Burna boy Burna boy abụghị onye eji ijide ọnụ ya aka mara dịka o mere ka ndị na-ahazi emume Coachela mara oge ọ sị na edighi aha ya ọfuma oge ha kpọro ya ka ọ bịa. Gụọ maka akụkọ ahụ ebe a: Ndị otiegwu Naịjirịa ga-apụta na Coachella. Eziokwu bụ na mba ụwa ugbua, onweghi onye otiegwu Naijirịa na-ewu karịa nwaamadị a. Ọkachasị ya bụrụ na ọ bụ afọ 2019 bata 2020 ka a na-ekwu okwu ya. Ọ bụ n'afọ 2019 ka oritere nturu ugo a kpọrọ ""Best International Act"" n'ogige ""BET Awards"". Ọ pụtakwara ka onye ụlọọrụ Apple Music kpọrọ ""Next Up Artist"". Efele egwu nke anọ etiputara ritekwere ntụ ugo a kpọrọ ""Album of the Year"" n'ogige ""All Africa Music Awards"" ma nwetekwa ohere iso zọọ ntụ ugo Grammy nke 2020. Agbenyeghị ike a niile Burna Boy kpara, ọ bụghị ya ka akacha ekiri ihe nkiri eguw ya na Youtube. Onye tụ ugo ahu bụ Davido, Ebe Sinach, Yemi Alade, Tekno na PSquare na-eso ya n'azụ. Etu egwu 7 akachasị ekiri ihe nkiri ha siri kwụrụ n'ụtụtụ 13-02-2020: Egwu Burna Boy gbagotere bụ ""On the Low"" mmadụ nde 96 kirigoro na 'youtube'. Nke a pụtara na ya na nke PSquare gbara nhatanha. Anyị aghaghi ekwu na ọ bụ Burna Boy kachasị agụ egwu, maọbu na o bu ya kachasị kemgbe Fela Kuti. N'otu aka ahụ, anyi aghaghịkwanụ asị o bụ Fela kachasị agụ egwu kemgbe egwu malitere na Naịjirịa makana egwu bụ na ntị onye. Nke bu eziokwu bu na Burna Boy na-anwa ọfụma. Ndi ọzo na-anwakwa nke ha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe ndị ị kwesịrị ime tupu ị nyapụ ụgbọala gị kwa ụbọchị" afirika-44410035,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44410035,Ụmụ nwaanyị chọrọ ka gọọmenti kwụwa ha ego ọmụgwọ,Ụmụ nwaanyị e kwola na ha chọrọ ka gọmentị kwụọwa ha 'ego ọmụgwọ-pụrụ-iche'. Nke a na-esote ozi gọmenti wepụtara na ha agbatịala oge ha ga-anọ nọ ọmụgwọ.,"Gọọmenti enyela Ginika na Chimemela, nwa ya ikike ị nọ ọmụgọ ọnwa anọ zụrụ ezụ Ụmụ nwaanyị ndị ọrụ oyibo n'Enugwu steeti kelere gọọmenti etiti maka atụmatụ ọhụrụ ewepụtara nke kwuru na ụmụ nwaanyị ga na-anọzị ọmụgọ ruo ọnwa anọ, ha rịọrọ ka a kwụwa ha ego ọmụgwọ. Na mkparịta ụka ha BBC nwere, ha nyere gọọmenti ndụmọdụ ka ha gbado anya hụ na ụlọ ọrụ niile mejupụtara iwu ahụ n'ụlọ ọrụ dị iche iche. Ngozị Ugwu bụ onye ọrụ ọyibo nwere olile anya n'iwu ọhụrụ a ga-abara ya uru. N'okwu ya Ngozi Ugwu rịọrọ gọọmentị ka ha nyere ụmụnwaanyi ọkachasị ndị ọrụ gọọmentị aka belata ahụhụ ha na-ata na-ịmụ nwa site na ịkwụ ha ego ọmụgọ pụrụ iche. Ọ sịrị, ""Ọ bụghị nanị ịnye ụmụmwanyị ọnwa anọ bụ ihe anyị chọrọ, ọ ga adị mma ka gọọmentị kwụwa ụmụ nwanyị Ego-ọmụgọ pụrụ iche iji nyere ha aka n'ọrụ ezinaụlọ."" Ugwu kwakwara arịrị na ụfọdụ ndị na- ewe ọrụ na- ajụzị iwe ụmụ nwanyị ka na amụ nwa n'ọrụ. Makana ha na-atụ egwu na ha nwere ike mụọ nwa gaba ọmụgọ ọnwa ole ma ole. Ọkaiwu Uche Aroh katọrọ ụlọọrụ dị icheiche kwụrụ onwe ha ndị na-achụ ụmụnwaanyị dị ime n'ọrụ ma ha mụọ nwa, ebe ụfọdụ ji obi ọjọọ na-akwụ nwaanyị nọ n' ọmụgwọ ọkara ụgwọ ọnwa ya ganye na ọ laghachite n' ọrụ. Ọkaiwu Uche Aroh bụ ọkaikpe onye ọrụoyibo n'Enugwu Aro nyere ụmụnwaanyị ụdị ihe metụtara ndụmọdụ ka ha gbaa ụlọọrụ mere etu a akwụkwọ n'ụlọikpe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49276187,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49276187,Uche Ogbodo: Arahụrụ m n'okpuru 'step' mgbe m malitere ime ihe nkiri,"Uche Ogbodo bịara BBC Igbo maka emume 'Ginị na-Afịọ' were kọwa ọtụtụ ihe banyere ya, ọkachasị etu o si malite ime ihe nkiri Nollywood.","Content is not available End of Facebook post, 1 Nwaada Ogbodo si na ya tara ezigbote afụfụ mgbe ya malitere, mana dịka onye chi ya nyere akaraka ime ihe nkiri, onwetere ohere igosi onwe ya. ""Ọkwa otu puku naira ka a na-akwụ anyị ụfọdụ mgbe, ụfọdụ oge, agaghịdị akwụ. Mana, uche dị n'ihe m na-eme."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ na-adị agbagwoju ya anya ma ụmụagbọghọ na-amalite ime ihe nkiri na-akọ maka ndị na-asi ha ka edina ha tupu enye ha ohere isonye n'ihe nkiri. Ogbodo tinyekwara ọnụ n'usoro eji enye nwata ara dịka a na-apakọ izu inye nwa ara (Ọgọst 1-7) nke Bekee kpọrọ ""World Breast Feeding Week"". Nwaada Ogbodo sị na ọ bụ ihe ọma nwata ịṅụ ara ọfụma ma ya bụrụ na nne mụrụ ya ga-emenwu ya. O kwuru nna ya nyere nwa ya ara n'agbanyeghị egwu ọtụtụ ụmụnwaanyị na-atụ na inye nwa ara ga-eme ka ara ha daa n'ihi uru dị na ya. Mana o kwuru na ya enyeghị nwa ya ara n'usoro Bekee kpọrọ 'exclusive breastfeeding' maka ọrụ ya enyeghị ya ohere ime etu a. Ihe ndị ọzọ Ogbodo tinyere ọnụ na ya bụ etu ụmụnwaanyị ga-esi na agbanarụ mwakpo maọbụ ime ihe ha achọghị ime na ngalaba Nollywood. ""Enyeghị m ohere ka ihe ọbụla dakwasị m. Ọ bụ igosi onwe m n'atụmatụ ""auditioning"" ka m jiri enweta ohere niile m nwetara ime ihe nkiri dị iche iche."" Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro ""Ọ bụ puku naira ka a na-akwụ m mgbe ahụ. Ufọdụ oge, agaghị akwụ m ihe ọbụla.""" afirika-44160641,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44160641,A kpọdoro ụmụakwụkwọ n'elu obe n'Ogun steeti,Ndị uweojii nwụchịrị Afolayan Joseph bụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ e kechiri ụmụakwụkwọ abụọ n'obe ma na-apịa ha ụtarị makana ha abịaghị akwụkwọ n'ọge.,"Otu n'ime nwata akwụkwọ ndị a kpodoro n'elu obe Ndị nkụzi abụọ si n'ụlọakwụkwọ ahu akpọrọ Metorite Standard School dị n'obodo Ayetoro nke n'Ogun steeti sokwa na ndị aka ji maka ịhe a mere ụmụaka n'ụtụtụ ụnyaahụ Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch siri kwuo, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ wakporo otu onye uweojii a kpọrọ Livinus ka ọ na-achọ ị tọghapụ ụmụaka ahụ. Livinus na ụfọdụ ndị agabtobi mechara tọghapụ ụmụaka ahụ ma kpọ kwa ndị uweojii ibe ya. Ka ndi uweojii a bịara ha nwụchịrị ndịọrụ ụlọakwụkwọ ahụ. Onye na-ekwuchite ọnụ ndịuweojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi kọwara BBC Igbo n'ekwentị na anwụchiela ndị ahụ. Oyeyemi kwuru na ndị ọrụ ụlọakụkwọ ahụ mefere ihe oke n'ịkpodo ụmụakwụkwọ nelu obe. N'onu ya, ""ihe ha mere jogburu onwe ya, anyị agaghị anabata ya, anyị ga-eme nyocha zuru oke ma kpụpụ ha ụlọịkpe"" Ndị mmadụ n'ekwu n'elu igwe okwu maka ahụhụ dị ịcheịche n'ụlọakụkwọ sekondrị: @knoxpete gosiri ụdị ahụhụ ọ tara n'ụlọakwụkwọ sekondrị Ebe @Xcel_101 kwuru maka oke ụtarị apịara ya n'ụlọakwụkwọ Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51354205,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354205,Fire Outbreak: Ụlọọrụ Inec agbaala ọkụ n'Ọrlu dị n'Imo Steeti,"Ndị a na-amatabeghi ndị ha bụ agbala ụlọọrụ Inec dị n'okpuruọchịchị Orlu nke Imo steeti ọkụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde 3, Febụwarị 2020.","Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Ọ sị na onweghi onye merụrụ ahụ mana ndị uweojii ka na-eme nyocha ịchọpụta etu ọkụ a ji malite. Akụkọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ngwaọrụ ndị ụlọọrụ Inec sọ na ihe ndị gbara ọkụ. Ihe a bụghị nke mbụ a na-awakpo otu ụlọọrụ a na nso nso a. Na ntuliaka afọ 2019 ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ma bukọrọ ngwaọrụ dị n'ime ya. Nzukọ Buhari na ndị isi ụlọomeiwu Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila nwere nzukọ taa nke a na-amabeghi ihe bụ isi nzukọ ha. Mana kepu kepu na-ekwu na ha gara igwa Buhari nyocha ha metara banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Onweghi nwafọ Naịjirịa bu Coronavirus Onye na-anọchiteanya mba Chaịna na Naịjirịa bụ Zhou Pingjian sị na onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla bi na Chaịna bu ọrịa coronavirus. Pingjian sị ndị Naịjirịa bi n'obodo ebe ọrịa a malitere dị iri isii. N'egwuregwu Neymar na-agbara PSG bọọlụ haziri oriri iji cheta ụbọchị ọmụmụ ya mana onye nchịkọta ha bụ Thomas Tuchel ekweghi aza oku Neymar kpọrọ ya. Tuchel sị na oriri a bụ mmegharị anya nye ya dịka ha nwere asọmpi n'abalị abụọ na-abịa. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a gbasara Fada Ebube Mmụọnsọ ga-amasị gị: ' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ BBC World Service na-eme nrụrịtaụka nke a kpọrọ 'BBC World Questions' Site n'aka ekpe ruo n'aka nri: Joe Igbokwe, Aisha Yesufu, Osita Chidoka, Hadiza Bala Usman BBC World Service na-eme nrụrịtaụka nke a kpọrọ 'BBC World Questions' na mpaghara mbaụwa niile gụnyere Naịjiria. N'atụmatụ a, ndị mmadụ ga-enwe ohere ịjụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị isi nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu ajụjụ ihu na ihu. Ọ bụ site n'ihe ndị mmadụ jụrụ ka ndị a kpọtara ga-esi kpaa nkata. Onyeisi BBC na Naịjirịa bụ Toyosi Ogunseye na ndị ọnụ na-eru n'okwu bụ Hadiza Bala Usman (onyeisi ụlọorụ Nigerian Ports Authority), Osita Chidoka bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchitere APC na Legọs steeti na Aisha Yesufu bụ onye na-ahụ maka ikike dịrị onye, ga-eso eme nrụrịtaụka a. Ndị ụlọorụ British Council na-akwado BBC ịhụ na ụbọchị ahụ gara nke ọma. A ga-eme emume a n'elekere isii nke mgbede, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị 2020, na MUSON Centre dị na Legọs steeti. Ọ bụrụ na ị chọrọ isonye n'emume a? Pịa aka n'akara a www.britishcouncil.org.ng/events/bbc-world-questions-lagos Mmachi keke na-enye ndị Legọs nsogbu Ndị bi na Legọs na-etisi mkpu ike na-akwa akwa arịrị maka ụdịrị ahụhụ ha na-ata kemgbe gọọmentị steeti ahụ machiri ndị ọkada na keke ịgba n'ụfọdụ ụzọ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha kwụrụ ụgwọ iji ịnyịnya gaa ebe ha chọrọ ịga Ndị mmadụ, ọtụtụ bụ ndị pụtara n'ụzọụtụtụ ịchọ etu ha ga-esi aga mkpa ha n'ụtụtụ a, ka kwụ n'ụzọ na-eche ka ụgbọala rute ha, ebe ndị ọzọ ejirila ụkwụ gaa ogologo ụzọ. Ọgụ achaala n'etiti ndị uweojii na ndị ọkada na keke na mpaghara Ijora dị na Legọs. Akụkọ si ebe ahụ eru anyị ntị na-akọwa na a na-akwa mgbọ ebe ahụ, dịka ndị mmadụ na-agbakwa taya ọkụ n'ụzọ. Chaịna na-atụ Amerịka aka ọjọọ Gọọmentị Chaịna sị na Amerịka na-ebusa ụjọ kama ịchọ ụzọ ha ga-esi nyere ha aka Gọọmentị mba Chaịna ebola mba Amerịka ebubo itinye ndị mmadụ oke ụjọ na obi mmapụ n'ahụ site n'etu ha si ekwuputa maka ọrịa Coronavirus. Nke a na-abịa dịka mba Amerịka kwuru na ha agaghị ekwe ndị mba ha gara Chaịna n'ime izu abụọ kemgbe ọrịa a nyewere ezigbo nsogbu, bata. Nzọgbu nzọgbu Enyimba enyi! Otu egwuregwu Enyimba zọgburu enyi ndị FC San Pedro nke mba Aịvorị Kost iji wụbanye n'agba mgbapụ nke asọmpi CAF Confederations Cup. Enyimba ruru agba ọkara-ikpeazụ tupu a gbapụ ha n'asọmpi a n'afọ 2018, ji goolu ise asatara naanị abụọ merie. China arụọla ụlọọgwụ ọhụrụ n'ime otu izu Ndịagha na-ahụ maka ahụike ga na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ọhụrụ a Nwanne biko tuo Chaịna 'ekwu eme'!!! Ị ma na ha arụchaala ụlọọgwụ ọhụrụ ahụ ha malitere ịrụ n'izu gara aga maka ilekọta ndị mba ha bu ọrịa Coronavirus? A ga-emepe ụlọọgwụ ahụ nwere akwa otu puku n'oge adịghị anya, dịka ndị na-arụ ebe ahụ ga-abụ ndịagha na-ahụ maka ahụike. Ụlọọgwụ ahụ ha kpọrọ ""Huoshenshan Hospital"", dị n'obodo Wuhan bụ ebe ọrịa Coronavirus a malitere. Mara na ọrịa a egbuola mmadụ 361 na mba Chaịna, ebe ihe karịrị mmadụ puku 17 ka bu ya bụ ọrịa. Ozi ndị Chaịna ziputara n'ụtụtụ a gosiri na a gwọtara mmadụ 475 bubu ọrịa a, ebe a ka na-enyocha mmadụ 152,700. Maka ọnwụ osote onyeisi NADECO Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ Arthur Nwankwo bụbụ osote onyeisi otu National Democratic Coalition (NADECO) nakwa ndị Anambara steeti aka n'obi n'ihi ọnwụ ya. Nwankwo bụ odeakwụkwọ dere akwụkwọ ndị gụnyere Danda, My Mercedes is Bigger than yours, nakwa Tales out of school. A kpụ Boko Haram n'ọnụ ọzọ Boko Haram na-ewu na soshal midia ugbua dịka ndị Naịjiria na-ajụ ajụjụ ịmata ihe mere gọomentị Naịjirịa ji gbaghara ihe karịrị mmadụ iri asatọ n'ime ha. Nke a na-abịa dịka e jidere otu onye a na-enyo na ọ bụ onye Boko Haram ji ogbunigwe ga n'ụlọụka dị na Kaduna steeti. Super Bowl nke mba Amerịka Ihe na-ewu ugbua n'ụwa egwuregwu bụ mmeri Kansas City Chiefs meriri San Francisco 49ers n'asọmpi Super Bowl nke bọọlụ mba Amerịka. Mmeri a mere ya mbụ ndị Chiefs na-emeri na Super Bowl n'ime afọ iri ise. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị" afirika-48742612,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48742612,Ethiopia Coup: 'Egbuola' onyeisi ndị mere 'coup' n'Ethiopia,"Onye bụ isi miri atụmatụ ịchụtụ aka na-achị mpagara Amhara n'Etiopia anwụọla, dịka ndị ntaakụkọ na mba ahụ na-akọ.","Atụhapụrụ Ọchịagha Asaminew na mkpọrọ n'afọ gara aga Akụkọ ahụ sị na ndị uweojii gbagbụrụ Ọchịagha Asaminev Tsige na gburugburu isi obodo Amhara bụ Bahir Dar. Ndị chọrọ ịchụtụ onyeisi Amhara gburu onyeisi Seare Mekonnen ka ọ na-achọ ịkwụsị njem ndị a chọrọ ịchụtụ gọọmentị. Aka na-achị Etiopia bụ Abiy Ahmed si ka ndị mba ahụ makọọ onwe ha iji megide ndị ajọ obi. Onye ga-eweghachita akụ Bauchi steeti Gọvanọ na-achị Bauchi Steeti bụ Bala Mohammed etiela mkpu na onye chiburu steeti ahụ bụ Mohammed Abubakar mefuru nde naira abụọ na ụma n'ihe gbasara akwamozu. Bala Mohammed ṅụrụ iyi na gọọmentị ya ga-eweghachite ego nile ndị chịburu steeti ahụ zupuru. Onye ji ibe ya ụgwọ nsọpụrụ? Nkwanye ugwu na-ewu na soshal midia Naịjirịa ka ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ n'omume ekwuru na otu okorobịa kpasara Ọkammụta Wole Soyinka. Akụkọ a dị na Twitter sị na nwaokorobịa ahụ ekweghị ịhapụrụ Soyinka oche n'ụgbọelu. Ma omere etu kwesiri ma omeghị bu ihe ndị mmadụ kpụzị n'ọnụ. N'egwuregwu Otu bọọlụ Ivory Coast ji otu ọkpụ asatghị emeri mba Sawụt Afrịka dịka ha na-achịpụ ya ugbua Ebe anyị nụrụ na ọgba bọọlu Naijiria bụ Shehu Abdullahi agaghị eso n'egwu mgbe ndị Super Eagles ga-ezute mba Guinea maka ahụ ọ merụrụ. Onweghị ndị ọchị ehi anyị bunyere ngwaagha - NAF Ndị agha ụgbọelu nke Naịjirịa agọọla ụkwụ na aka ha na onweghi ngwaagha ọbụla ha ji ọgbọelu helikọpta bunye ndị na-achị ehi n'obodo Akwuke dị n'Engugu Steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị agha ụgbọelu nke Enugwu Steeti bụ Faith Aigbeoghain sị na ebubo a eboro ndịagha bụ ezigbo asị katara ahụ. Akụkọ kwuru na ngwụcha izuụka gara aga, ndị Enugwu nọ n'oke ụjọ n'ihi ụgbọelu helikọpta ndị agha nọ na-efegharị n'obodo. Akụkọ gara n'ihu kwuo na ụgbọelu a mechara fedata ala n'obi ndị ọchị ehi dị n'Akwuke ma bunye ha ngwaagha. Mana Aigbeoghain akatọọla ebubo a ma gwa ndị bi n'Enugwu ka ha gbara ịtụ ụjọ ọbụla na o nweghi nsogbu dị. Super Eagles ekeela nkwụcha n'ụlọ ndina ha Akụkọ kwuru na otu nwoke a na-akpọghị aha ya batara n'ụlọ ndịna ndị Super Eagles na mba Ijipt ma soro ha hie ụra na-enweteghi ikike ọbụla. Nke a mere eji nye ndị nkaakụkọ ndụmọdụ ka ha kpọtụrụ Toyin Ibitoye tupu ha gara ịhụ ndị Super Eagles ma ọ bụ atụọ one ahụ mkpọrọ. Obi adala unu mba - Buhari gwara ndị Zamfara Steeti Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola gọọmentị Zamfara Steeti na ndị bi na ya ka ha ghara ịda mba n'ihi mwakpo a na-eme ha. N'ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, Buhari sị ka ndị bi na Zamfara nyere gọọmentị etiti aka n'ịchọpụta ndị na-eyi ndụ egwu na Steeti ahụ. Buhari kwuru nke a n'ozi nkasi obi o zigara ndị steeti ahụ maka mwakpo e mere ha na nso nso a, nke tara isi ọtụtụ mmadụ n'okporoọchịchị Tsafe. Seriake Dickson adọọla ndị ntọrị aka na ntị Gọvanọ Bayelsa Steeti bụ Seriake Dickson ekwuola na ọ ga-etinye aka n'akwụkwọ ikike maka igbu ndị ntọrị ọbụla a mara ikpe ọnwụ na steeti ahụ iji dọọ ndị ntọrị aka na ntị. Dickson kwara arịrị na ndị a na-atọrị ndị mmadụ a bụ ndị otu na anọghị n'ochịchị nyere ngwa ọgụ n'oge ntuliaka. N'ofesi Oke ọdachi mere na mba India mgbe ọke ifufe na mmiri ozizo kwaturu akwa mbochi bụ Tent ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na anọ merụọ iri ise ahụ na Rajasthan. Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a sị na ọkụ latrik dọgburu ebe ndị ọzọ bụ ndị igwe eji arụ ụlọ dagburu. N'egwuregwu N'asọmpi Iko mba Afrịka, Ọọjerịa ji ọkpụ goolu abụọ menyụọ ndị Kenya anya iji bụrụ ndị mbụ na tebulu ha. N'aka nke ọzọ Ajentina jisiriike gafe n'agba ọzọ nke asọmpi Copa Amerịka site n'iji ọkpụ abụọ merie Qatar. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Igbo Language: Gịnị bụ 'Slay Queen' n'asụsụ Igbo?" afirika-50436952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50436952,Bayelsa and Kogi Elections: Taa bụ oge a kara aka na ntuliaka Kogi na Bayelsa Steeti,"Ụbọchị ndị bịara tupu ụbọchị ntuliaka jupụtara oke ndọrọndọrọ n'etiti People Democratic Party, PDP na All Progressive Congress, APC bụ pati isi okpokpo abụọ na-ama aka ọkwa gọvanọ na steeti abụọ ndị a.","E nweela ọgbaghaara dị ịche iche n'ihi nke a dịka nke mere n'ọgbakọ ndị PDP na Nembe ebe e gburu ihe ruru mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ. Otu ihe ahụ mere na Kogi steeti ebe a wakporo isi ụlọọrụ otu Social Democratic Party, SDP. Ụfọdụ ndị bu egbe wakporo otu ụlọ ndina ebe gọvanọ Oyo Steeti bụ Seyi Makinde nọ n'ụbọchị Fraide. Na Kogi Steeti, pati iri abụọ na anọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2019, mana ndị mmadụ na-ahụta naanị pati abụọ APC (Yahaya Bello) na PDP (Musa Wada) dịka ndị kachasị gbapụta ihe. Na Bayelsa Steeti, ruo mgbe ụlọikpe kachapụrụ aha David Lyon (APC) na Douye Diri (PDP), ha abụọ bụ ndị kachasị pụta ihe n'ịzọ ọkwa a. Mana ụlọọrụ Inec sị na pati abụọ ndị a ka so na-azọ ọkwa a. Ndị debanyere aha ịtụ vootu na Bayelsa dị 867,088 ebe 769,609 anatala kaadị vootu ha nke pụtara pasentị 83.35 dịka ụlọọrụ Inec si kwuo. Ka ọ dị ugbua, ngwa ọrụ niile e ji eme ntuliaka a erutele ebe niile a na-edebanye aha bụ Registration Area Centres (RAC) n'okpuruọchịchị asatọ dị na Bayelsa Steeti ruo na wọọdụ niile nakwa ebe niile a na-atụ vootu n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu dị na Kogi Steeti. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" afirika-49751952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49751952,Coscharis Group: Etu N200 jiri gbanwe bụrụ ide ego n'aka m,"Onye ojiego achụa ego a ma ama bụ Cosmas Maduka onye e ji Coscharis mara, kọwara etu o siri bụrụ ide ego na mkparịta ụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2019.","Maazị Maduka sị na ya bidoro njem ịchụ ego ya n'ịgba bọị, tupu nna ya ukwu eji narị naịra abuo duo ya n'afọ 1976. Lee etu o siri gbarie njem ya: Etu o sibido Maduka kọwakwara etu o si malite njem azụmahịa ya wee ruo n'ogogo ọ nọ ugbua. Ọ kọwara na ""Coscharis"" bụ nchịkọta aha ya na nwunye ya bụ Cosmas na Charity. Ọ kwụsịrị agụmakwụkwọ n'elementarị nke atọ ma bido ịmụ ahịa n'aka nna ya ukwu bụ onye ji naanị N200 dụọ ya ụlọ n'afọ 1976. Ọ bụ ahịa akụrụmgwa ọgbatumtum ka o jiri bido. Ihe mere Cosmas Madụka jị bụru Ide 1) Ndụmọdụ na nkwado Nne ya ""Agụụ chineke mere ka m hara igahe ụzọ."" Cosmas Maduka Nne ya bụ ezigbote onye na-ekpere chineke, ọ gwara ya ka ọ nwee okwukwe na Chineke nakwa n'ime onwe ya. Nne ya kuziri ya etu e si ekpe ekpere ma nye ya ndụmọdụ etu o ga-esi bie ezigbo ndụ. Mama Madụka mere ka ọ nwee ezigbo olileanya na okwukwe na ihe ga-agaziri ya. Madụka sị na onweghi ike iwepụ anya n'ebe Chineke nọ. 2) Inwe atụmanya makaọdịnihu Cosmas Madụka dị afọ iri na itolu mgbe ọ lụrụ nwunye ya ""Onweghị ihe dịka ihu ụzo (Vision) ọ ga enyere gị aka imata ihe i ga-eji ndụ gị mee."" Cosmas Maduka Mazi Cosmas Maduka rịọrọ ndị ntoroọbịa ka ha bido n'oge chụwa ewu ojii. Madụka kwuru na onweghị ihe o mere ma mmadụ bido n'afọ iri na abụọ nwee ihe ọ na-atuanya n'ime ndụ ya. o kwuru na ihe niile abụghị ihe ndapụta maka na e nwere iwu na-ahazị ihe n'ụwa. Mazi Madụka kwuru na mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ marala ihe ọ chọrọ ibụ. Ọ dekwara n'akwụkwọ na tupu ọ ruo afọ iri abụọ na atọ na ọ ga-ego ụgbọala nke ya. Ọ sị na o mezuru nke a ka o si dee ya. Ọ gwara BBCIgbo na ihe mmadụ na-eme taa ga-egosi ihe ọ ga-abụ na mgbe na-adịghị anya. 3) Onye ọbụla kwesiri inwe onye nduzi (Mentor) Onye ọ bụla kwesiri inwe onye ga-edu ya ma soro nzọ ụkwụ onye ahụ. O kwuru na ọ bụ mgbe ọ gbara nna ya ukwu ""Boy boy"", ka ọ chịkwara onwe ya ma soro ezigbo nzụ ụkwụ dịka nwata. 4) Igba mbọ na ịkwụwa aka ọtọ Coscharis bụ ndi nnochite anya FORD na Naijirịa "" Ego 'dot.com' ga efukwa ka 'dot.gone' "" Cosmas Madụka Cosmas Maduka gwara BBC na ebe ọbụla mmadụ chọro i ga n'ụwa a, ọ gbado anya ọ ga-erute ya. Mana ọ dị kwa mkpa ka onye ahụ kwụwa aka ya ọtọ. Ọ sị na ọ bụ ndị Japan mepere ya ụzọ n'ahia. O kwuru na ọ bụ ikwụwa aka ya ọtọ mere ka ndị ụlọọrụ Japan tukwasị obi n'ebe ọ nọ ma mepere ya ụzọ. Maduka kwukwara na ọ bụ ezi omume a mere ka ụlọọrụ ya bụ Coscharis ji na-anọchite anya ụlọọrụ dịka Jagua, Rolls Royce, Range Rover na Ford na Naịjirịa. 5) Uzọ ndụ ""Ndi enweghị ebe ha na-aga ga-achọ ka gị na ha nọrọ n'otu ebe."" Cosmas Maduka Ọ naghị ele ihe onyonyo, kama ọ ga-ele ihe onyonyo ya gụọ akwụkwọ. Enweghị ihe onyonyo mekwara ka ya na nwunye nwee ezigbo mmekọrịta. Ọ bụ akwụkwo mgbasa ozi ka o ji amata ihe na-eme. Mazi Madụka na-eri ezigbote nrị na-edozi ahụ. 6) Ichụso ọdịnihu Mazi Maduka nwere ala rụrụ oke ala 3,000Ha ebe ọ kọrọ osịkapa n'Anambra steeti. Kama ọ bụ naani 1,200Ha ka ha na-akọ ugbua. Ọ kwuru na Naijirịa na-emefu Ijeri naịra atọ n'ibubata osikapa, na ọ chọrọ inweta pasentị iri abụọ na ise (25%) n'ime ego a. Ọ ka na arụ ya, mgbe ọ rụchara ọ ga-enye ndị mmadu ruru 3,000 ọrụ. Ihe nkiri ga-amasị gị Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara Akụkọ ga-amasị gi Ihe nkiri ga-amasị gị Migration: Ntaramahụhụ ụmụ Afrịka na-agabiga n'ịga mba Amerịka" afirika-44949160,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44949160,Lee eziokwu ihe mere n'ụlọ Ekweremadu,"Ndị uweojii na ndị ọrụ EFCC gbara ụlọ Ekweremadụ gburugburu ụnyaahụ, dịka ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichukwu si kwuo.","Anichukwu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ọ bụghị naanị ndị EFCC bịara, n'agbanyeghị na ndị uweojii kwuru na ha abịaghị gbochie Ekweremadu. O kwukwara na ndị uweojii agụta agụta gbara ụlọ ya gburugburu dịka ọ bụ okeọhịa Sambisa . O kwukwara na o nwere ka ọ dị maka na ndị EFCC zitere akwụkwọ ozi ha ji kpọọ Ekweremadu oku ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ndị ha boro ya, ma bịakwa n'ime otu ụbọchị ahụ ịbịa gbochie ya ịza ya bụ oku. N'okwu Ekweremadu gwara ndị ntaakụkọ ka mgbochi ya kwụsịrị, o kwuru na ndị EFCC gbochiri ya ruo awa isii. Anichukwu kwuru na ha ekweghị ndị mmadụ pụọ maọbụ bata. Ihe ndị omeiwu bịara mee Anichukwu gwara BBC Igbo na ndị omeiwu (ma ndị PDP ma APC, ma ndị ugwu, ndịda, ọwụwa-anyanwụ na ọdịda-anyanwụ) bịara ileta Ekweremadu, na ọbịbịa ha gosiri na nkwado ha kwụ chịm. Gere ihe Anichukwu gwara anyị n'uju: Ndị gbochiri Ekweremadụ ekweghị onye ọbụla pụọ maọbụ bata - Anichukwu Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-50565495,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50565495,Chelsea vs West Ham: A kpọọla Chelsea ntu n'isi na be ha,Obi na-agbawa ndị na-akwado Chelsea ugbua maka etu ndị West Ham ji were ha gbụchara ọnụ.,"Goolu Aaron Cresswell nyere n'ime nkeji 48, zuru ịkpọnye ntu n'obi nakwa n'akpati ndị Chelsea, makana ha asatanwughi otu mkpụrụ goolu ahụ. Na nkeji 71, a gụfuru goolu Michail Antonio nyere, dịka e kwuru na aka metụrụ ya. Ndị Chelsea gbara elu gbaa ala, mana isi ha apụtaghị n'agbanyeghi nkeji ise e tinyekwuru n'egwuregwu ahụ a gbara na Stamford Bridge. End of Twitter post, 1 Nke a bụkwanụ mmeri mbụ West Ham na-emeri Chelsea na Stamford Bridge n'ime afọ 17. Chelsea ga-ezute Aston Villa n'ụbọchị anọ nke Disemba, ma zutekwa Everton n'ụbọchị asaa nke ọnwa ahụ. Man City a na-akwọzị mmiri ka azụ? Ndị Newcastle enyeghi Manchester City ohere imebọ ha n'ọgbọegwuregwu St James Park ka ha lere ha ọbịa taa. Ha ji goolu na-asa onwe ha okwu, ghara imenye onwe ha ihere n'azụ ụlọ ha ka ndị Man City buteere ha egwu. N'ime nkeji 22 e ji bido bọọlụ ka Raheem Sterling gbakara neetị Martin Dubravka, mana Jetro Willems sara ya na nkeji 25 iji sị ha 'kwanyere onwe ha ugwu o'. Man City megidere nweta goolu ọzọ na nkeji 82, site n'aka Kevin De Bruyne, mana Jonjo Shelvey sara ya na nkeji 88, iji sị ha 'gbara ọgwụ ha ṅụọ'. Onye lawa onye lawa ha gbatara, mere ka Man City nweta otu pọịntị n'ime atọ; ma mee ka ha nọrọ na pọịntị 29. Nke a mere ka Liverpool bụ ndị ha na ha na-azọ onye ga-anọ n'isi tebulu, jiri pọịntị 11 na-aga ha ugbua. Ha ga-ezute Burnley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba, ma zute oke iro ha bụ Manchester United n'ụbọchị asaa. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee Ugwuta, obodo ọma nọ n'akụkụ mmiri" 48898751,https://www.bbc.com/igbo/48898751,"Egypt vs South Africa: 'Ndị Ijipt ị hụrụ ugbua, ị gaghị ahụ ha anya ọzọ'","Anya ndị otu egwuregwu South Afrịka ji wee pụta ịsọ mpi na ""Africa Cup of Nations"" (AFCON) na-eme ugbua pụkwara iche.","Ha kụpụrụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Ijipt, chụlaa ha ma febanye n'agba anọ nke ikpeazụ. Ndị Ijipt gbara mbọ na-ewebata ndị ọgba bọọlụ aghara aghara, mana Thembinkosi Lorch nara ha ụra rahụ mgbe o nyere goolu kwofere ndị Saụt Afrịka ka nkeji iri asatọ na ise gachara. Mahmoud Trezeguet bụ onye kara ịzọ ndị Ijipt n'asọmpị ahụ, gbanyere bọọlụ n'aka onye na-eche goolu kama ịgbanye ya n'ime ọjọgọrọ goolu. Etu ọ dị ugbua, Ijipt esorola Kamerun n'azụ dịka ndị achụpụrụla n'asọmpị AFCON 2019, ebe Saụt Afrika ga-aga Kaịrọ ebe ha na ndị Naịjirịa ga-achịpụ ya n'agba anọ nke ikpeazụ n'abalị iri nke ọnwa Julai. Mohammed Sala anọzikwa nke a a na-eme? Oke osisi Ijipt bụ Mohammed Salah sokwa n'asọmpị ụnyahụ mana ya bụ agha riri ya maka na akụkọ na-ekwu na o jichaghị ahụ wee bịa gba ya bụ bọọlụ. Nke a mere ka ọ na-agbachapụ agbachapụ n'asọmpị ahụ dịka ndị mmadụ si kwuo n'elu Soshal midia. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46820862,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46820862,Seasonal Fruits: Mkpụrụosisi ndị ị ga-eji tụọ ndụ gị mmanụ ugbua,Mkpụrụosisi bụ ihe mmadụ nwere ike iji tagharịa ọnụ maọbụ werekwa mere nri na-eju afọ.,"Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ewere mkpụrụosisi mepụta ihe ọṅụṅụ nke Bekee na-akpọ ""juice"" nakwa nke a kwọrọ akwọ a na-akpọ ""smoothie"". Mana otu ihe ị ga-ama maka mkpụrụosisi bụ na ọ na-enwe oge, dịka otu ilu ndị Igbo na-ekwu na ""ụkwa ruo oge ya ọ daa"". Etu a ka o si abụ ma oge mkpụrụosisi ruo; mgbe ahụ ka ọ na-aka acha ọfụma na-ekpughị ya akwa makwa kacha tọọ ụtọ. Mkpụrụosisi ndị nke oge ha bụ ebe ọnwa Disemba na Jenụwarị 1) Ụdara: Ụdara abụghị mkpụrụosisi ị ga-emetụ ọnụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị oge ya, makana ọ ga-adị gị ka ebe e ji akantị marichaa gị anya. Ọ na-aka mma ma ọ bụrụ na mmiri amatụla ya obere, maọbụ na o ji aka ya dapụ n'osisi kama ịghọtu ya tupu ị rachaa ya, mana ọ bụghị oge niile ka ọ na-eche mmiri tupu ọ tọọ ụtọ. Nke na-atọ ụtọ, a na-akpọ ya ""ụdara nwannu"". Ọ bụ mkpụrụosisi nwere egwu nke ya (ị ga-asị na ị maghị egwu ""ụdara m too...ụdara m chaa, ụdara m daa...). Ihe ọ na-enye n'ahụ: 2) Akị awụsa: N'agbanyeghị na akị awụsa na-epu n'Ugwu Awụsa, ọtụtụ ndị Igbo anaghị eji ya egwu egwu maka ụdịrị ụtọ ọ na-atọ. A na-ata ya ka ụkwa achị n'aka, (makana a na-enwe nke kpọrọ akpọ na nke dị ndụ) mana ọ na-aka mma ibanye nke ịkpọ ahụ na mmiri ọkụ ka ọ kwe ọtịta. A na-akwọ ya akwọ eji emepụta ihe a na-akpọ ""mmiri akị awụsa"" maọbụ ""tigernut milk"" na Bekee. Ihe ọ na-enye n'ahụ: 3) Ube mgba/ube okpoko/Ube Okwe: Ube mgba nke ndị Ugwu na-akpọ ""atịlị"" yiri ube nkịtị ahụ e ji ata ọka, mana o pekarịrị ya na mpe. Ọ na-ahakwa mmanụ karịa ube igbo. Ebe mkpụrụ ube igbo anaghị ara ahụ agbawa, a na-ejinwu mkpụrụ ube mgba azụ nchọrọ. A na-esi ya n'ọkụ ka o ruo tupu a rachawa ya. Ụfọdụ na-etinye ya nnu tupu ha arachaa ya, mana ị ga-arachanwu ya etu ahụ. Ọtụtụ ndị amaghị nke a, mana a ga-ejinwu mmanụ pụtara na ya esi nri, nke ndị ma maka ya na-ekwu na ọ ka mmanụ e ji esi nri mma ma a bịa n'ihe ọ na-enye n'ahụ nakwa ụtọ ọ na-enye nri. Ihe ọ na-enye n'ahụ: 4) Okpete: Ọtụtụ ndị na-esi na ya ewepụta shuga ha na-aṅụ karịa nke arụpụtara arụpụta. Ọ na-atọ bịrịbịrị nke ukwu, mere ndị Bekee ji akpọ ya ""sugar cane"". A bịa na Naịjirịa, ọ na-epukarị n'Ugwu Awụsa. A na-ebu ụzọ akpụchapụ azụ ya tupu a taa ya. Ihe ọ na-enye n'ahụ: Dọkịnta Ikenna Emedike kwukwara na ọ dị mma ka ndị mmadụ na-eri mkpụrụosisi ndị a mgbe ọ bụ oge ha iji gbalahụ irite nje. O kwukwara na ọ bụ oge mkpụrụosisi dị n'oge ya ka ọ na-aka enye ihe n'ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44782248,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44782248,World Cup 2018: France ejirila 1-0 merie Belgium,"Otu abụọ a siri ike n'egwuregwu mana Frans gbapụrụ Beljiọm, nke ga-eme ka Beljiọm na onye emeriri n'etiti Ịngland na Kroeshia zute ma zọọ ọkwa onye nke atọ Bekee kpọrọ 'third place'.","Goolu Umtiti ji isi taba na neetị nyere Frans mmeri mere ka ha banye n'agba ikpeazụ nke atọ ha n'ime afọ 20. Blaise Matuidi, Raphael Varane na Kylian Mbappe nwukere ka kpakpando n'egwuregwu a. Nkeji 90+6: E gbuchiela bọọlụ. Nkeji 90+5: Frans na-anwasi ike inye goolu ọzọ. Nkeji 90+4: E nyela Vertonghen akwụkwọ edo edo. Nkeji 90+3: Griezmann gbara shọọtụ mana Courtois ghọrọla ya. Nkeji 90+1: E nyela Mbappe akwụkwọ edo edo maka ịghọ aghụghọ na a gbaturu ya. E tinyekwuola nkeji isii. Nkeji 90: Beljiọm ewepụla Chadli tinye Batshuayi. Nkeji 89: De Bruyne chọrọ ibunye Lukaku bọọlụ mana ọ banyeghị etu o kwesịrị. Nkeji 87: Beljiọm agbaala 'free kick' ha nwetara, mana N'zonzi ji isi tafuo ya ka ọ ghara ibanye na poostu ha. Nkeji 86: E nyela Kante akwụkwọ edo edo maka igbatu Hazard. Nkeji 85: Hazard na Matuidi akụkọọla ọzọ. Mere ka Frans wepụ ya tinye Tolisso. Nkeji 84: Frans ewepụla Giroud tinye N'zonzi. Nkeji 82: Ndị nlekọta abịala kpọrọ Matuidi ka ya na Hazard kụkọtara ọnụ, mana ọ lọghachịtara. Nkeji 81: Beljiọm anwaala poostu ọzọ site n'aka Witsel, mana Lloris kụpụrụ ya. Nkeji 80: Beljiọm ewepụla Fellaini tinye Carrasaco. Nkeji 79: Hazard butere bọọlụ, Giroud gbaturu ya n'ihu poostu mana enyeghi ya 'free kick'. Nkeji 78: Griezmann gbara 'corner' ndị Frans. Pogba nwetara ya mana isi ya apụtaghị. Nkeji 75: De Bruyne butere bọọlụ n'ihu poostu mana isi apụtaghị. Onye ka ị chere ga-ebuli iko mba ụwa? Nkeji 73: A gbaala Umtiti bọọlụ n'agba. Nkeji 70: E nyela Alderweireld akwụkwọ edo edo. Nkeji 68: Frans enwetala 'free kick' n'aka Griezmann. Nkeji 65: Fellaini tara bọọlụ Mertens bunyere ya isi n'ihu poostu, mana ọ banyeghị. Nkeji 64: Hazard na-agbagharị ịma ma ọ ga-enweta bọọlụ nye goolu. Mertens agbaala shọọtụ mana Lloris ghọrọla ya. Nkeji 63: E nyela Hazard akwụkwọ edo edo. Nkeji 61: Beljiọm nwetara ohere inye goolu site n'aka Mertens na De Bruyne mana ọ banyeghị. Lloris ghọrọla nke De Bruyne. Nkeji 59: Beljiọm ewepụla Dembele tinye Mertens. Nkeji 55: Giroud ebuteala bọọlụ ka Matuidi bunyere ya bọọlụ, mana otu abụghị n'ezi. Nkeji 51: GOOOLLLUUU!!!! Umtiti ejirila isi nye goolu. Nkeji 47: Witsel bunyere Lukaku bọọlụ ọ tara isi, mana ọ gafere elu poostu. Nkeji 46: E nwebeghị onye nyere goolu n'ime egwuregwu a. Egwu ebirila ọkụ n'ọkara nke abụọ. A gaala ezumike nkeji 15. Nkeji 45: E tinyekwuola otu nkeji n'ọkara a. A ga-ejinwu ya mere ihe? Umtiti butere bọọlụ gaara aba na neetị mana ọ kụrụ n'aka Lukaku pụọ. Nkeji 44: Griezmann gbara 'free kick' mana ọ gafeghị ahụ ndị Beljiọm kwụchiri ihu poostu. Cheta na Thierry Henry gbabuuru Frans bọọlụ ma soro n'otu buliri Iko Mbaụwa n'afọ 1998, bụzị osote onye nchịkọta otu Beljiọm. Nkeji 39: Pavard gbara shọọtụ mana ụkwụ Courtois tinyere mere ka bọọlụ pụọ 'corner' mana enweghị ihe Frans ji ya bụ 'corner' mee. Nkeji 37: Giroud dina n'ala, ndị nlekọta bịara ileta ya maka ahụ ọ merụrụ ka ya na Dembele kụkọtara. Nkeji 36: Frans kesara ezigbo okwe ka ha butere bọọlụ n'ọkara ndị Beljịọm, mana Griezmann agbataghị ihe ọ chọrọ ịgba. Nkeji 33: Giroud na Griezmann na-acha ndị Beljiọm ọkụ dị iche n'ọkara a. Nkeji 32: Frans etetala n'ụra ka ha bidoro chawa Beljiọm ọkụ. Giroud nwetara bọolụ, mana ọ banyeghị. Nkeji 30: Griezmann gbafeere Pavard 'free kick' ha nwetara. Pavard gbaliri ya elu, Giroud tara bọọlụ isi n'ihu poostu Beljiọm, mana ọ banyeghị. Nkeji 28: De Bruyne mere ka Umtiti gbafuo bọọlụ n'ihu poostu, mere ka Lukaku ghara inweta ohere igbakpu ya na neetị. Nkeji 25: Matuidi na Hernandez metere 'corner' nke Griezmann gbara nso poostu mana Fellaini tafuru bọọlụ ka ọ hara ịbanye na poostu Beljịọm. Nkeji 21: Lloris akụpụla bọọlụ Alderweireld gbara sitere na 'free kick'. Ọ bịara n'ihu poostu. Nkeji 18: Hazard ebutela bọọlụ n'ihu poostu ndị Frans, mana ọ kụrụ n'elu poostu dapụ. Nkeji 17: Matuidi agbaala shọọtụ, mana Courtois ghọrọla ya. Nkeji 15: Hazard ebutela bọọlụ ka De Bruyne bunyere ya, mana ọ gafere ihu poostu kama ibanye n'ime ya. Nkeji 12: Mbappe ebutela bọọlụ gbapụ ọsọ n'ihu poostu Frans ka Pogba bunyere ya bọọlụ, mana oche goolu ghọrọla ya tupu o nweta ohere ịgba ya na poostu. Nkeji 10: Frans nwetara ohere n'ihu poostu ndị Beljịọm, mana isi apụtaghị. Nkeji ise: Hazard agbaala shọọtụ! Mana ọ pụrụ 'corner'. Nkeji anọ: Frans bu egwu bịa egwuregwu a, ha achọghị inye ohere maka ihe ọbụla. Otu nkeji: E bidola egwuregwu ọkara-ikpeazụ n'ọgbọ egwuregwu St. Petersburg. Nzukọ a mere ya ugboro 74 otu abụọ a na-ezute ibe n'egwuregwu bọọlụ. N'ime otu abụọ a, Frans ebuola Iko Mbaụwa n'afọ 1998, mana nke a bụ ugboro isii ha na-eru n'agba ọkara-ikpeazụ. Irute ọkara-ikpeazụ a, Beljịọm merichara egwuregwu ise ha gbara. Ndị nọ n'oche Beljiọm: Koen Casteels, Simon Mignolet, Adnan Januzaj, Youri Tielemans, Thomas Vermaelen, Thorgan Hazard, Leander Dendoncker, Yannick Carrasco, Dries Mertens, Michy Batshuayi, Dedryck Boyata. Ndị nọ n'oche Frans: Alphonse Areola, Steve Mandanda, Presnel Kimpembe, Corentin Tolisso, Benjamin Mendy, Steven N'Zonzi, Ousmane Dembele, Djibril Sidibe, Thomas Lemar, Adil Rami, Florian Thauvin, Nabil Fekir. Ndị Beljiọm bidoro bọọlụ: Thibaut Courtois; Vincent Kompany, Toby Alderweireld, Jan Vertonghen; Axel Witsel; Nacer Chadli, Mousa Dembele, Maroaune Fellaini, Kevin De Bruyne; Romelu Lukaku, Eden Hazard. Ndị Frans bidoro bọọlụ: Hugo Lloris; Benjamin Pavard, Raphael Varane, Samuel Umtiti, Lucas Hernandez; N'Golo Kante, Paul Pogba; Kylian Mbappe, Antoine Griezmann, Blaise Matuidi; Olivier Giroud. Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" afirika-51813256,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51813256,Emir of Kano: Ndị Eze ọdịnala ndị ọzọ achụpụrụ n'oche dịka Sanusi,Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-etị aka n'obi ka achụtụrụ Sanusi Lamido Sanusi dịka eze obodo Kano.,"Ufọdụ na-ajụ kwa asị ""kedu etu onye jị ntọrọndọrọ ọchịchị banye n'ọchịchị si nwe ike ịchụpụ onye omenala ndị tinyere n'ọchịchị?"" Iji ghọta etu onye dịka Gọvanọ Umar Ganduje siri nwe ike ịchụpụ ọnye ọchịchi ọdịnala, ka anyị kọwara gị etu ọ sịrị bido. Akụkọ mgbe ochie Dịka akụkọ mgbe ochie ndị obodo Kano sị we kwuo na ọ bụ Bagauda bu Eze mbụ Kano. Ọ bụ n'afọ 1805 ka ndị Fulani chụtụrụ ha n'ọkwa. Etu ike ndị Eze sịrị daa Ọ bụ ndị mba Briten chuturu ndị Fulani ọchịchị dịka ndị ọchịchị ọmenala nwere ike mgbe ha meriri ha n'agha n'afọ 1903. Ha napụrụ Aliyu Babba onye bụ eze kano oge ahụ ọchịchị ma dupu ya na Lokoja. Ha chịkọtara mpaghara niile were kpọọ ya ""Kano Emirate"" nke dị n'okpuru ọchịchị Briten. Jaja bụ kwa onye Eze ọzọ ndị mba BRiten napụrụ ọchịchi n'aka Ọ bụ iwu nke afọ 1954 akpọrọ ""Littleton Constitution"" napụrụ ndị ọchịchị omenala ọtụtụ ike ha nwere itinye aka n'ọchịchị maọbụ ịhọpụta ndị ọchịchị. Iwu a nyefere ndị ụloọmeiwu ukwu na nke nta ikike ọchịchị niile. Iwu 'Republican Constitution"" nke afọ 1963 nyere gọọmentị ọchịchị onyekwuoucheya ikike ime eze maọbụ iwepụ mmadụ dịka Eze. Iwu nke 1979 nyere iwu na ndị ọchịchị omenala agaghị azọ maọbụ nwee oche na ọchịchị gọọmentị. Mana ọ bụ iwu nke afọ 1999 napụrụ ha ike niile ha nwere dịka ndị eze ma nyefee ha niile n'aka gọomentị. Ihe a pụtara na ndị e ji ndọrọndorọ ọchịchị họpụta nwere ike karịa ndị Eze ọdịnala na Naijirịa. Kedu ndị Eze gọọmentị Chupụgoro n'ọchịchị? Eze Kano Muhammad Sanusi I na-anabata Eze na Eze Nwaanyị Gloucester Ndị mba Briten chitụrụ ọtụtụ ndị eze na Naijirịa were napụ ha ike. Ndị eze dịka Jaja of Opopo, Ovonramwen Nogbaisi nke Bini n'afọ 1897, Oba Adeyemi Adeniran II nke Ọyọ na ndị ọzọ. Ọ bụ nchụtụ eze ndị a mepere anya ndị mmadụ ha were hụta na-enwere ike ịnapụ ndị Eze ike. Ngwa lee ndị eze gọọmentị Naijirịa chụpụ goro n'ọchịchị: Muhammad Sanusi nke mbụ Eze Sanusi nke mbụ na ụmụ ụmụ ya nke Eze Muhammad Sanusi nke abụọ so n'ime ha Muhammad Sanusi bụ nnanna Sanusi Lamido Sanusi. Ọ bụ nwoke mara ihe ma bụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na mpaghara ugwu. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ọzịzọ ọchịchị dị na-etiti ya na Ahmadu Bello mere ka achụpụ ya n'ọchịchị. Ọ bụ goọmentị mpaghara ugwu chụpụru ya n'afọ 1963 site na nyocha akporo ""Muffet Probe"" maka etu o si ahazị akụnaụba ya. Sanusi Lamido Sanusi maọbụ Muhammad Sanusi II Ndị na-eso akụkọ ndọrọndorọ ọchịchị ga-ama na ọteela aka Sanusi na Gọvanọ Kano bụ Abdullahi Umar Ganduje nwere nghọtaghe. Nchutu Sanusi bidoro dịka ndị mmadụ bidoro na-ede akwụkwọ ka goomentị nyọocha etu o sị achị ọchịchị. Ụfọdụ akwụkwọ ndị a bụkwa ebubo na Sanusi na-ere ala ndị eze ọ na ekwesịghị ire. Na Disemba afọ 2019 ka Gọọmentị sị na okpuru ọchịchị Sanusi kwapụta oche eze anọ ọzọ nke mere ka ebe Sanusi bụ eze site na okpuru ọchịchị iri anọ na anọ buruzịa nanị iri. Sanusi bụ Emir pụrụiche dịka ọ na-etinye ọnụ n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị, ofufe, akụnaụba na ezinaụlọ. Nke a were ọtụtụ mmadụ iwe n'ihi na ndị Emir anaghị ekwu oke okwu. Ọ bụ ebubo na ọ kwanyeghị iwu obodo ugwu kwesiri mere ka achụpụ ya n'ọkwa. Ibrahim Dasuki Eze Ibrahim Dasuki bụ eze Sokoto nke iri na asatọ. Ọ bụ n'afọ 1996 mgbe Sani Abacha nọ n'ọchịchị ka achụpụrụ ya. Ha chụpụrụ ya maka ebubo na ọ na-ebute ekworo na etiti ndị obodo Sokoto, erubeghị gọọmentị ntị ma ịme njem na anataghị goọmentị ikike. AlMustafa Haruna Jokolo Almustafa Haruna Jokolo bụrụ Eze obodo Gwandu n'afọ 2005. Gọọmentị Kebbi mgbe Adamu Alero nọ n'ọchịchị ewepụrụ ya n'ọkwa. A chụpụrụ ya maka ebubo na ọnaghị akwanyere iwu obodo ugwu. N'afọ 2014 ka ụlọikpe elu dị na Kebbi nyeghachiri ya ọchịchị. Oba AdeyemiAdeniran II Ọ bụ tupu Naijirịa enwere onwe ha ka achụpụrụ Oba Adeyemi Adeniran II n'oche. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ maka na ọ dọnyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị NCNC nke Nnamdị Azikiwe bụ onyeisi ha butere esem okwu n'etiti ya na Obafemi Awolowo. Esem okwu a mere ka Awolowo kpọọ nzukọ ndị Eze ala Yoruba niile bụ ndị nwere ikike ị chụpụ Adeniran n'ọkwa. Ọ bụ n'afọ 1954 ka achụpụrụ ya n'ọkwa. Umaru Tụkụr Umar Tukur bụ Eze Muri mgbe enwere Gongola steeti n'afọ 1966. Ya na Gọvanọ mgbe ahụ bụ Yohana Madaki nwere nghọtaghe. Madaki nyere iwu ka achụpụ ya n'ọchịchị maka agwa ọjụọ na ihe ndị ọzọ ọ mere n'afọ 1986." afirika-50858653,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50858653,Dreadlocks: Ihe omimi dị n'isi dada,A na-ahụkarị ndị nwere ntutu dada dịka ndị pụrụ iche.,"Ndị Igbo kwenyere na ha bụ ndị Chineke nyere ikike pụrụ iche. Duruagwu nke abụọ n'Ụmụnakara, Imo steeti bụ onye omenala na adị mma sị na ndị dada na-abụkarị ndị mmiri. Ọ sị na otu esi achọpụta ha bụ na ụmụaka ahụ na-ebekarị oke akwa mgbe a na-akpụ ha isi. Ọ sị na isi ụmụaka ahụ anaghị ekwe ọbụbọ mgbe a na-achọ ịbọ ya. ""Isi ha na atụhie atụhie"". Mgbe ahụ ka e ji amata na ha bụ dada kwusizie ịmetụ ha aka n'isi. Ọ bụghi mmadụ niile na emetu ha aka n'isi. Ọ bụghịkwa mgbe niile ka ana asarụ ha ahụ n'isi, dịka Duruagwu kwuru. Mgbe ụfọdụ a na-etinye ha ego ayọrọ maọbụ ego mkpọpụ n'isi iji tụjụnata mmụọ ha. Ọ bụ afa n'ekwu mgbe aga eji akpụ ha ya bụ isi. Maọbụ onye ahụ toruo ogo ọ gwa ndị be ha ka akpụọ ya isi. Mgbe a ga-akpụ ya bụ isi, onwere omenala a ga-emere ya. Omenala a gụnyere ịmere ndị dada ibe ha na ụmụaka ndị ọzọ oriri. A na-egburu ha ọkụkọ ọcha na mmanya. A na-agọkwara ọfọ tupu a kpụọ ha ya bụ isi, ịkọwa na anaghị akpụpụ ndụ ha na ya bụ isi. Mgbe ụfọdụ, isi ọnwụ ịkpụ isi dada ha nwere ike ịnwe nsogbu dị iche iche nke gosiri na ha ekwesighị ịkpụ ya bụ isi. Ndị dị otu a na-amalitekwa iru ya bụ isi n'okenye. Mana ihe ndị a agụnyeghị ndị ji aka ha mee ntutu ha dada maka ịchọ mma. Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52594098,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52594098,Anambra state: Lee ihe Eze Umumbo na Omor kwuru maka ọgbaaghara dara n'etiti ha,"Dịka ọgbaaghara dara n'etịtị obodo Omor na Umumbo, ọtụtu akụkọ na-efegharị n'Intanetị kama onweghị onye ma nke bụ eziokwu.","Ihe a bụ foto ochie Mana otu ihe pụtara ihe bụ na ọ bụ nsogbu ala butere ya bụ esemokwu. Ndị mgbasaozi nke Anambara steeti kwuru na mmadụ iri ise bụ ndị a na-achọ achọ ebe ihe ruru mmadụ narị atọ bụ ndị e ji mgbọ egbe na obejiri merụọ ahụ. BBC kpọtụrụ ndị uweojii na ndị Eze obodo abụọ a ka anyị mata ihe mere. Ihe ndị uweojii kwuru Ndị uweojii kwuru na ọ bụ otu onye nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ. Ha kwukwara na ha ejidele mmadụ asatọ aka ha dị n'ihe mere. Ihe ndị Eze obodo ndị a kwuru. Igwe Oranu Chidume Igwe Oranu Chidume nke obodo Omor na Igwe Solomon Ikechukwu Chidubem nke ndị Umumbo kwuru na ha bụ ụmụnne na-emekọ nke ọma. Ha kwuru na ọ bụ ndị na-akọ osikapa bụ ndị butere ya bụ okwu. Gere ihe ha kwuru n'uju ya ebe a. Esem okwu n'etiti obodo Ummbo na Omor Dịka ọ dị ugbu a, ndị nchekwa nọ n'obodo abụọ ndị a. Ugbụ a bụzị oge udo dịka ndị Eze abụọ siri kwụọ na ha na-agba mbọ ihu na udo batara n'obodo abụọ ndị a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47605580,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47605580,Everton vs Chelsea: E kpunyela Chelsea okpu ogwu taa,Chelsea kwọrọ aka tiere Everton akị na asompi nke Premier League nke mgbede Sọnde a ebe ha jigidere bọọlụ ihe ruru pesenti 67 ma ghara ịgba aka ahịa maọlị n'ọkpụ goolu abụọ Everton nyere ha.,Ike ụwa agwụ Hazard Lee nnọọ ka ndị dị ike sị daa (How are the mighty fallen) 2 Sam 1:19. Everton bụ otu egwu bọọlụ eji ọnyụpa mara nke mere ha ji nọrọ na ogogo nke 11 n'elu tabulu Premier League ahụ. Mana ha gbara mbọ ịkputu Chelsea n'ala site n'iwe ọkpụ goolu abụọ wụkpọọ ha anya.. Onye egwu ndị Everton bụ Richarlison ji isi tinye goolu mbụ ha n'aka eru nwata Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu ndị Chelsea mgbe ọ kụrụ nkeji 49. Arrizabalaga kwuru na ya abụghị nkata mgbe oji nwaanyọ butuo penariti Gylfi Sigurdsson bụ onye gosiri ya nkarị na nkeji 72 mgbe o nyere goolu nke abụọ bụ nke o ji gbaara Chelsea ụgbọ nwamkpi. Mmeri a dọghachiri Chelsea azụ tinye ha na ndị nke isii na tebulu Premier League. Eden Hazard kpọkwara ganịganị ịgbara isi onwe ya mana Jordan Pickford nke Everton gwara ya na nkiti ga-azụ n'ahịa udele taa. Otu a ka Chelsea sị gbara aka nkiti laa taa. Akụkọ ga-amasị gị afirika-51368120,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51368120,Imo State: A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha,"Emeka Ihedioha ụlọikpe chụpụrụ n'oche gọvanọ Imo steeti, gwara BBC Igbo na mgbe e kpechara ikpe a na ọ nabataghị ya, mana o nweghi ihe ọ ga-emenwu maka na ọ bụ ụlọikpe kachasị kpere ya bụ ikpe.","Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị Kama na ya na ndị ọkaiwu ya nyochara ikpe ahụ ma chọpụta na o dị ka o nwere ohere ịlaghachị ka ndị ọkaikpe lebagharịa anya n'ikpe ha kpere. Nke a bụ maka na ebe ha gbakwasịrị ụkwụ kpee ikpe a nwere ihe na-edoghi anya n'ime ya. O kwukwara na mgbe e mere ntuliaka ma kpọpụta ya dịka onye meriri, na o nweghi mgbe e kwuru na o nwere ọdọ ebe a na-atụ vootu dị 388 ha jiri tụkwasị n'elu vootu Hope Uzodinma. Mgbe a jụrụ ya maka ngagharịiwe ndị PDP na-eme maka ikpe a, Ihedioha sị na ọ bụghị ya gwara ndị PDP mee ngagharịiwe. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị PDP mere ngagharịiwe, kama na ndị mmadụ maara na ikpe e kpere ezighi ezi. N'ajụjụ ihe mere o ji dịka o ji aka ike achụ Rochas Okorocha bụ onye ọ natara ọchịchị, o kwuru na ihe o mere bụ ihibe kọmitii ga-ahụ maka iweghachịta akụnaụba ndị Imo Steeti a kpachiri akpachi. Na ihe o mere bụ ihe ndị Imo Steeti chọrọ n'aka ya, na ọ dịghị mma otu onye ikpachikọ akụnaụba gọọmentị bụ nke ọha nwe. Ihedioha gara n'ihu kọwapụta ọtụtụ ihe ndị ọ rụpụtara n'Imo Steeti n'ime ọnwa asaa ọ nọrọ n'ọchịchị. Mana mgbe BBC Igbo gbara Okorocha ajụjụ banyere etu Ihedioha si akpaso ya agwa, ọ sị na ọ bụghi akụnaụba Imo Steeti mere ya onye ọ bụ. Na ọ kpatachaala ego tupu ọ bụrụ gọvanọ. Na gọọmentị Ihedioha na-akpa agwa ka ụmụaka kama na ihe mere o jiri gba nkịtị bụ maka na ọ chọrọ udo n'Imo Steeti. Okorocha gara n'ihu kwuo na ọnọdụ ya n'ime Steeti ahụ dịka nke ọnọdụ onye nna n'ime ezinaụlọ bụ onye na-eme udo n'oge niile. Kirie nke a n'uju. Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ" afirika-43837525,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43837525,Chimamanda kwuru na a wakporo ya n'ike oge ọ bụ agbọghọ,"Onye ode akwụkwọ a ma ama na Naịjirịa bụ Chimamanda Ngozi Adichie, kwuru na e nwere nwoke a ma ama n'ihe gbasara ntaakụkọ nwakporo ya n'ike mgbe ọdị afọ 15.","Ụmụnwaanyị na ekwupụtazị mwakpo e mere ha n'atụmatụ ha kpọrọ #MeToo O kwuputere ihe a na Stockholm Forum ebe ọ gara ọgbakọ e mere maka ikwu maka nhatanha nwoke na nwaanyị. Adichie bụ onye kwuru okwu mmechi n'ọgbakọ ahụ, kọwara na ihe a mere mgbe o dere akwụkwọ mbem ọ chọrọ ibiputa. O nyere otu nwoke ọ sị na ọ bụ ""nnukwu mmadụ na ntaakụkọ"" akwụkwọ a maka na o chere na ọ ga-enyere ya aka mee ka ndị mmadụ mara maka akwụkwọ ya. Ọ kọwara etu nwoke a si manye aka n'okpuru akwa ya wee pịa ya aka n'obi. Ihe a mere nwoke ahụ ka gwachara ya na ọ bụ nnukwu ihe na o dere akwụkwọ ahụ o dere. Ọ sị: ""Obi mapụrụ m nke ukwuu mere na m enwenwughị ike ime ihe ọbụla n'ihe ruru ntabianya otu maọbụ abụọ, mana enwetara m onwe m, wee jiri nwayọ kpachapụ aka ya, makana achọghị m ikpasu ya iwe."" ""E mechara oge ahụ, ihe were gbakasịa m n'ihu, olu na obi, ọ dị ka ahụ m ọ na-akụja, dị ka ọ na-ekwu ihe ọnụ m ekwunwughị,"" Adichie kwuru. Lee onyoyo mgbe Chimamanda kwuru maka ""feminism"" ebe: Chimamanda akọwapụtala onye ""feministị"" bụ" afirika-53053930,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53053930,Uchechi Kanu: 'Ihe Nnamdi Kanu ji ego Ipob eme',Akụkọ na-efegharị na soshal midia gbasara Nnamdi Kanu na ebe o si enweta ego.,"Ọ bụrụ na i chetere, Nnamdi Kanu na Asari Dokubo boro onwe ha ebubo nrụrụaka. Dokubo pụtara n'ihe onyonyo bo Kanu ebubo na ọ na-anata ego n'aka ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ. Na mkparịtaụka BBC Igbo na nwunye Kanu bụ Uchechi nwere n'afọ 2018, ọ kọwara ebe di ya si enweta ego na ihe o na-eji ego Ipob eme. Ọ kọwakwara etu o si akpata ego nke ya. Gee ya n'uju ebe a. Akụkọ ga-amasị gị:" 47228838,https://www.bbc.com/igbo/47228838,"Nnamdi Kanu, gbara ọgwụ gị ṅụọ - Nnia Nwodo",Ndị Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ agọọla ebubo na ha ma ime mere ede jiri bee nwịị na ihe nnamdi Kanu gabigara n'oge Ndịagha Naijiria gbara Egwu Eke n'ụlọ ya.,"Na mkparịtaụka BBC Igbo na nnamdị Kanu nwere na Lọndọn na nsonso, nwa amadị ahụ bọrọ ebubo na Umahi na gọvanọ ndị ọzọ tinyere Ohaneze kpara nkata igbu ya. Mana aka na-achị Ebonyi steeti ma bụrụkwa onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi kwuru na aka ha dị ọcha n'ebe Kanu nọ. O kwuru na ọ bụ Kanu bụ isi kotere ebu gbara ya n'ihi nọ o geghị ntị na ndụmọdụ Ndị gọvanọ na ndị okenye igbo nyere ya. Umahi kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Emma Uzor, sịrị na ""ọ bụghị eziokwu."" Uzor kọwara na Gọvanọ Umahi gara mba ofesi oge ndịagha wakporo ụlọ Kanu. O kwukwara na Umahi bụ onye bekuru onyeisiala ngwangwa ọ nụrụ ihe mere ka ha kpọbụ Ndị agha n'ụlọ Kanu n'ihi na ọnọdụ ha ebe ahụ na-ebute ọgbaghara na ogbụgbu mmadụ. ""Ka awakporo Nnamdị Kanu Gọvanọ batara hụ ihe na-eme kpọọ onyeisiala ka ha kpọbụ Ndịagha n'ụlọ Nnamdị Kanọ."" 'O bu Umahi rịọrọ Onyeisiala e were kpọbụ ndịagha wakporo ụlọ Nnamdi Kanu' Uzor kọwara na ndị gọvanọ na Nnamdị nwere ọgbakọ ebe ha nọrọ nwe nkwekọrịta na Kanu ga-eji nwayọo so okwu mnwereonwe Ndigbo, hapụ ị na-akparị ndị okenye n'agbụrụ Yoruba,Igbo na Awụsa. Ha boro Kanu ebubo ịgbahapụ nkwekọrịta ha na ndị gọvanọ nwere. Nnia Nwodo, onyeisis otu Ohaneze kwenyere na nhazighari Naijiria na mpaghara na mpaghara N'ọsịsa ya, onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo onye kwuru na 'ọ bụghị ụja niile Nnamdi Kanu gbọrọ ka anyị ga na-asa"" kwuru na ebubo Nnamdị Kanu bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ. Nwodo siri ọ kaa Kanu obi ya wepụta ihe akaebe gọsịrị na Ohaneze soro kpaa nkata igbu ya. ""Nke a bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ. Ọ ka ya obi ya weta ọbụladị mpekere ihe akaebe."" Ọ gara n'ihu jụọ ihe mere Kanu ji adonyere ndị iro Ndigbo ukwu site na ịkpọ oku ka a ghara ịtụ vootu."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52015665,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52015665,Coronavirus: Lee etu ụfọdụ ụzọ dị na Briten na Jamani ka mmachi ngaghari malitere,"Mba ụwa niile na-agba mbo ịhụ na ọrịa Coronavirus bịara na njedebe, ọtụtụ n'ime mba ụwa ehiwela mmachị ngagharị iji chekwa ndụ ndị obodo ha.","Ọtụtụ ndị mmadụ na-erubere mmachị gọọmentị Briten machịrị isi Ndị Naijirịa bị na mba Briten na Jamanị zitere anyị etu mmachị sị emetụta ha. Mba Briten Nwaafọ Naijirịa bị na Briten na-akọwa na dịka ọrụ ya bụ inya ụgbọ oloko na ya na-aga ọrụ ị hụ na ndị ọrụ gbata gbata ruru ụlọ ọrụ ha. Onye ọzọ kwa bụ onye nkụzị na mahadụm na mba Briten kwukwara na ọmetụtaghị ya dịka ọ bụ na Ịntanetị ka o ji akụzịrị ụmụakwụkwo ya ihe kamgbe. Lee ihe ha zitere anyị - Otụtụ ndị mmadụ nọ n'ime ụlo ha dị na 'East London' Ụgbọala nọ n'ụzọ pere mpe Ọtụtụ ndị mmadụ na-erubere mmachị gọọmentị Briten machịrị isi Ụgbọala na-agba okporo ụzọ nke 'South London' ebughị ibu Na Jamani Na mba Jamanị, ndị mmadụ na-akwado mmachi gọọmentị ga-eme. Otu nwaafọ Naijirịa bị na Jamanị sị na enweghị ọtụtụ ndị mmadụ n'okporo ụzọ. Ụgbọala nọ n'ụzọ pere mpe ma ndị nchekwa na-agagharị ịhụ na ndị mmadụ rubere mmachị gọọmentị isi. Dịka ndị mmadụ ji egwu azụcha ihe niile dị n'ahịa, ndị na-ere ahịa enweela opekete mpe ihe mmadụ ga-azụ mgbe ha biara ahịa. Lee ka o sị aga na mba Jamanị Ndị mmadụ na-eche ka ha zụta ihe n'ahịa kamgbe 6:30 ụtụtụ Lee ka ebe a na-edowe ngwa ahịa ka ọ sị tọgbọ Ụgbọ oloko tọgbọ chakọọ n'ụfọdụ ebe na mba Jamanị Ndị mmadụ azụchaala ihe dị n'ahịa" 48476458,https://www.bbc.com/igbo/48476458,Ihe ise mere Ndigbo ji alaghachi n'ịlụ ụbara Nwaanyị,"Ịlụ ụbara nwaanyị bụ ọdịwara gboo n'ala Igbo, ọ bụghị ihe ọhụrụ.","Ndị ụka na-ajụ ase n'aka ụkọchukwu ugbua Mana ugbua, ọ na-adọ ụfọdụ ụmụnwoke na nwaanyị n'akpịrị dịka mmanụanwụ na-adọ ahụhụ n'akpịrị. Na nsonso a, Ned Nwoko lụrụ onye ihe nkiri a ma ama bụ Regina Daniels ghọrọ okwu akụ n'ọnụ dịka akụkọ na ọ bụghị ya bụ nwaanyị nke mbụe na-ewu n'elu n'ala. End of Instagram post, 1 Na nkọwa onye ọdịnala, Dkta Mcginger Ibeneme na onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ mabụụkwa onye ụkọchukwu bụ Pastọ Sebastine Nwaneri rụtụrụ aka n'ihe ndị a : 1. Ndagharị oge Okpukperechi na-agbanwe. Ndigbo siri na ịgọ mụọ banye na otu Kraisti, si ebe ahụ na-agwa okpukpere abụọ ahụ ọnụ. Ugbua ụfọdụ na alaghachi na ịgọ mụọ na ihe ndị so ya. N' okwu Dkta Ibeneme, ịgba ama, ịjụ asa nakwa ịga n'aka ụkọchukwu ịjụ he ga-eme na ihe mere buru emela ụfọdụ n'alaghachi ịgba afa na ndụ mgbe ochie. Ọ sịrị, ""O bidoro na ọtụtụ ndị ụkọchukwu ha na-emezi okpukpere ha,ha na-eweta ihe omenala na-etinye."" "" Nwayọọ,nwayọọ, ndị be anyị na-alaghachi n'okpukperechi na omenala mgbe ochie."" Pastọ Nwaneri kpọọ ya, ""ọgwụgwụ oge', mgbe ndị mmadụ na eso ndị amụma asị ndị na-ahụrụ ha ọhụ. 2. Ịchọọ ụbara mmadụ/ Amụtaghị nwa Ụmụada Igbo Site na mgbe ochie, mmadụ na-atọ Ndigbo ka nnu. Ọtụtụ ndị gboo bụ ndị ọrụugbo ya mere ịmụta ụmụ ụbara na-adị ha mkpa. Nke a mere ha ji alụ ọtụtụ nwaanyị. Ugbua, amụtaghị nwa na-eme ka ụfọdụ Ndigbo lụọ karịa otu nwaanyị. 3. Ịchọ nwa nwoke Ịchọ nwa nwoke ebutela ọtụtụ ihe gụnyere ịlụ ụbara nwaanyị Ọzọ yiri ya bụ amụtaghị nwa nwoke dịka Pastọ Sebastine Nwaneri siri kọwaa. "" Ndigbo na-achọ ịmụ nwa nwoke. Ọtụtụ ndị na-alụ ọtụtụ nwaanyị na-achọ ịmụ nwa nwoke."" ""Ọtụtụ ndị ṅụrụ otu nwaanyị na-akwagharị iko ịchọ nwaanyị ga-amụtara ha nwa nwoke. "" Mana Nwaneri dụrụ ụmụnwoke ọdụ ""Ihe m na-agwa ha bụ na ọbụ nwa nwoke ga-anọchite anya gị, ịzụ nwa nwaanyị ọfụma, o g-emere gị ihe nwanwoke agaghị emeliri gị."" Ọ dụkwara ha ka ha na-ekenye nwaanyị oke n'ihe ha nwere. 4. Akpịrị nwaanyị maọbụ akpịrị ego Ụmụasa juru eju n'elu ụwa ugbua Ụmụnwaanyị Igbo mara mma dịka aja dị n'ala. Nwoke ejighị onwe ya aka maọbụ nke nwere anyakwu ga-achọ ịlụ otu na ụmụ 'mmụọmiri' na-akpagharị n'ụwa ugbua. Nwaneri onye bụ onyeisi Ụkọchukwu n'ụka Divine Impartation Assembly,Ikeja, Lagos kọwara,""Otu n'ime mkpụrụ onye chere echeghari na-amịta bụ mmadụ iji onwe ya aka. ""Ọ bụrụ n'ị lụọla nwaanyị, ịhụ ihe ụfọdụ iwepụ anya gị."" 5. Ụdị ejiji ụmụnwaanyị na-eji ugbua Nwaneri: Ejiji ụfọdụ ụmụnwaanyị na-etinye ụmụnwoke n'ọnwụnwa Ụmụnwaanyị na-eyi uwe mbenukwu ugbua ma ghewe akụkụ ahụ ha oghe aghara aghara. Pastọ Nwaneri kwuru na, ""Ekwensu emela ka ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eghbe akụkụ ahụ kwesiri ka egbuchie."" Akụkọ ga-amasị gị:" 43440306,https://www.bbc.com/igbo/43440306,"Na Kanọ, nwa Dangote agbala akwụkwọ","Fatima, nwa Aliko Dangote nke a mara dịka onye kachasị nwee ego n'Afrika gbara akwụkwọ ụnyaahụ.","Akụkọ kọrọ na e mefughị oke ego na agbamakwụkwọ nwa Aliko Dangote dịka ndị ọgalanya ndị ọzọ na-eme Jamil Abubakar bụ nwa otu onyeisi ndị uweojii oge gara aga kwụrụ ọkara nde naira dịka ego isi o jiri lụọ ya. Ọtụtụ ndị Najiria ọnụ na-eru n'okwu gara agbamakwụkwọ ahụ nke onyeisiala bụ Muhammadu Buhari nyefere nwa agbọghọ ahụ n'aka di ya. Emechara, Emir nke Kano bụ Malam Muhammad Sanusi II goziri di na nwunye ọhụrụ ahụ n'obi ya. Onyeisi ụlọ ọmewu Sineti bụ Bukola Saraki sọrọ ga mmemme ahụ. Ndị ọzọ gara agbamakwụkwọ ahụ gunyere Asiwaju Bola Tinubu, ndị Gọvanọ: nke Oyo steeti, Abiola Ajumobi; nke Kaduna, Nasir El-Rufai; nke Sokoto, Aminu Tambuwal;nke Kwara, Abdulfatah Ahmed;nke Kano,Umar Ganduje; nke Katsina, Bello Masari; nke Sokoto, Aminu Tambuwal; nke Kaduna, Malam Nasir El-Rufai wgz. Lee ihe ụfọdụ na-ekwu maka alụmdinanwunye ahụ na Twitter: Akụkọ ga amasị gị:" media-51170017,https://www.bbc.com/igbo/media-51170017,Liverpool vs Manchester United: Liverpool agwọọla Man Utd ka ji mpataka,Ọ bụ na nkeji iri na anọ ka ndị otu egwu bọolụ Liverpool nwetara kọna nke Alexander-Arnold jiri chọta isi Van Dijk.,"Ọ bụ nke bụ gọọlu mbu na asọmpị a. Na nkeji iri abụọ na ise, ndị Liverpool nyekwara goolu ọzọ kama ihe onynyo VAR kagburu ya. Mana ụfọdụ na asị na ọkwesịrị ị bụ goolu. Na nke yiri ibe ya bụkwa na nkeji iri atọ na isii ka ndị Liverpool nyekwara goolu ọzọ kama ogbu opi kagburu were sị 'off side'. Ndị Manchester United gbara mbọ lịka lịka ịsata goolu ahụ mana onweghị isi. Liverpool gosiri ha nkarị dịka ha nyere goollu nke abụo mgbe ọ fọrọ nkeji abụo ka egbuchie asọmpi a. Dịka ọ dị ụgbụa, Liverpool ka nọsịrị ike n'ọcheeze ha na EPL. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Biafra at 50"": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ""" afirika-46779700,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46779700,Biafra: Ebonyi chọrọ nke puruiche - Odeakwụkwọ gọvanọ Umahi,Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Emmanuel Uzo ekwuola na onweghi mgbe gọvanọ Umahi sị na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra.,"Onwere ụdị Biafra ndị Ebonyi chọrọ O kwuru nke a n'ajụjụ BBC Igbo gbara maka iji katọọ akụkọ na-ekwu na gọvanọ Umahi sị na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra. O kwuru na ụdị Biafra nke ndị Ebonyi Steeti chọrọ bụ nke ga-akwụrụ onwe ya n'ihe banyere akụnaụba, inyere ndụ aka na nwulite obodo. O kwuru na ọ bụrụ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ ga-agbakọta aka ọnụ ma rụọ Steeti ha, na nke a pụtara na Biafra erutela ndị Igbo aka. Uzo kwuru na ndị ntaakụkọ dere na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra aghọtaghị ihe gọvanọ Umahi kwuru nke ọma. N'ajụjụ banyere okwu ịtọrọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ, Emmanuel Uzo kwuru na onweghi mgbe gọvanọ Umahi kpọrọ ndị Ipob aha maka iyi egwu ahụ. O kwuru na ọ bụ eziokwu na gọvanọ Umahi nwetere ụdị ozi ahụ mana o sighi n'aka ndị Ipob bịa kama na nyocha ka na-aga n'ihu ebe ozi ahụ si bịa. N'aka nke ọzọ ọnụ na-ekwuru Ipob n'Abuja bụ Ụkọchukwu Peace ekwuola na ozi dị etu ahụ esighi n'aka Ipob bịa. Ụkọchukwu Peace kwuru na e be gọvanọ Umahi ejirila ọnụ ya kwuo na aka Ipob adịghị na ya bụ ozi na nke pụtara na aka ha dị ọcha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55440148,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55440148,"2021 Prophecies: Ihe Mbaka, Oyedepo, Adeboye, Suleiman na ndị ụkọchukwu mara n'amụma maka 2021","Dịka a banyere afọ ọhụrụ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu a ma ama na Naijiria atọpeela ngwugwu ihe ha 'hụrụ' ga-eme n'afọ 2021.","Ụfọdụ bụ okwu nkasi, ebe ụfọdụ bụ okwu na-enye nkoropụobi. Lee ụfọdụ n'ime ha: Naijiria ga-aba oge ihe isi Ike ọzọ - Fada Mbaka Ụkọchukwu Ụka Katọlik a ma ama ma bụrụkwa onye hiwere ""Adoration Ministry"" n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ala Naijiria ga-aba n' ihe isi ike kacha n'afọ 2021. Mana, ọ sị: ""n'ime ihe isi ike a, ụfọdụ ndị mmadụ ga na-eme ọfụma."" ""Ihe ga-esikatara ndị mmadụ ike mana ụfọdụ ndị mmadụ, afọ ga-abụrụ ha afọ kachasị mma ná ndụ ha."" O kwuru na ""ụfọdụ ezinaụlọ nọ n'ọzara a ga-agbapuru ha osimiri na 2021."" N'okwu coronavirus, Mbaka kwuru na Chineke ga-ebupu ya nụ ọrịa dịka a ga-esite ""n'afọ coronavirus jụrụ ga n'afọ a zachapụrụ coronavirus"". A na-achọpụta ọkwụ mgbochi Coronavirus, ụdị ọzọ a na-apụta- Adeboye N'amụma o buru na ụka mmalite afọ 2021, Onyeisi Ụka Redeemed Christian Church of God' bụ Enoch Adeboye kwuru na ""dịka a na-emepụta ọgwụ mgbochi Coronavirus, na ụdị nje ahụ ọzọ ga na-apụta, "" ganye na ụwa ekweta na n'ezịa nchedo si na Chukwu."" O kwuru na ""Ụfọdụ ihe ndị mere n'afọ 2020 ga-aganihu n'afọ 2021."" Ọ gara n'ihu sị, ""Chukwu chọrọ ka anyị nọ na Naijiria mata na naanị Chineke pụrụ igbo ọgụ."" Okwu 'Igbo Presidency' ga-akụsa- Ayodele Onye ndu ụka INRI Evangelical Spiritual Church bụ Elijah Ayodele, sị na ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 agaghị erute Igbo aka. Ọ sị: ""Zoning agaghị ekwe omume. E wepụ nke a, a ga-enwe ọtụtụ ndọrọndọrọ ụka maka ""zoning"", etu ahụ ka Igbo inweta ọkwa onyeisiala ga-adaa mmiri n'afọ 2023."" O kwuru na otu otu kara aka ga-apụta na-ekwusi ike maka Igbo inweta ọkwa onyeisiala. Ha ga-agbalị iwepụta ndị tozuru etozu. ""Ọtụtụ ndị Igbo na-achọ ịzọ ọkwa onyesisala ga-adapụ n'etiti ụzọ."" Ọnwụ onyeisiala Ayodele kwukwara na otu onyeisiala nọ n'ọkwa ọchịchị ga-anwụ, ebe otu onyeisiala chiburu mbụ ga-anwụkwa. Bola Tinubu Ayodele dụrụ Bola Ahmed Tinubu ọdụ ka ọghara imefu ego sị na ọ na-azọ ọchịchị. Aka gbara ụka mgba ga-ada- Oyedepo Bishop David Oyedepo nke ụka 'Living Faith Church Worldwide' a ma dịka ""Winners Chapel"", si na aka ọbụla megidere ụka ga-ada. Ọ gara n'ihu kwuo na ekwensu ji covid-19 ebuso ụka agha. Ọ sịkwara, ""Ụka bilie megide mmadụ, onye ahụ nke ya agwụla. Ụka bilie megide ọchịchị maọbụ ewumewu,ewumewu ahụ ga-ada."" Mana o kwuru na 'Anyị na-aga n'ala e kwere ha na nkwa."" Osote Onyeisiala ga-abụ Onyeisiala- Suleiman Ụkọchụkwụ a ma ama ma bụrụ onye nwe ụka Omega Fire Ministries International bụ Apostle Johnson Suleiman, kwuru na onyeisiala ga-abata n'oche agaghị esi n' Ugwu Naijiria. N'amụma ọ mara maka afọ 2021, Suleiman kwuru na ọ bụ onyeji ọkwa osote onyeisiala ga-abụ Onyeisiala. ""Ahụrụ m ka na-ahapụ Ugwu. Dinwenụ gwara m mụ ya na ntị m na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ.Ihe a bụ amụma. Naijiria agaghị ekwewa, Agha agaghị ada.""" afirika-51060271,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51060271,Buhari akatọọla ndị oji egbe gburu mmadụ 12 na steeti Platu,Mwakpo e mere n'ime obodo Kulben dị na Platu steeti ataala isi mmadụ iri na abụọ ma merụọ otu ọzọ ezigbote ahụ.,"Ndị uweojii sị ọ bụ n'ehihe Wenesde ka ndi oji egbe wabatara na ya bụ obodo ma malite kwawa mgbọ. Onyeisila Muhammadu Buhari katọrọ mwakpo ma sị na a ga-achọpụ ndi kpara mkpa mkpa a. NLC sị ndị Gọvanọ akwụbeghị ọgwọ ọnwa opekatempe sonye ọsịsọ Otu ndị ọrụ akpọrọ Nigerian Labour Congress enyela aka na-achị steeti dị iche iche na Naịjirịa ruo ngụcha ọnwa Janụwarị 2020 ịsonye qụọ ọgwọ ọnwa opekatampe ha na gọọmentị kwekọrịtala n'afọ 2019. Ha sị na ọ bụ sọsọ steeti isii malitere ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe a. N'Ofesi, Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Nwunye nwa eze Harry bụ Meghan ahapụla mba Briten gawa Canada dịka ya na di ya kwuru na ha na-awụsa ọwa n'iso n'ihe ndị be Ezenwanyị Eliza na-eme. Ezenwaanyị Eliza na onwe ya ekwuola site n'ọnụ ndi na-ekwuru ya na a na-achọ usoro nhazi ọnọdụ mmadụ abụọ a. N'Egwuregwu, Rangers buru iko NPFL n'afọ 2016 Ọ ga-akpọtụ akpọtụ n'Enugwu ụbọchị Sonde oge Rangers na otu egwuregwu Nouadhibou nke Mureshus ga-ezute onwe ha na ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe Asọmpị a bụ nzute nke abụọ otu abụọ n'iko CAF nke ọkpọ a . Ndị ntọrị atọrọla Seminarian anọ na Kaduna Ndi uweojii na Kaduna si ndị ntọrị yi uwe ndi agha tọọrọ ụmụakwụkwọ anọ n'ụlọakwụkwọ akpọrọ Good Shepard Major Seminary dị n'ụzọ Abuja. Ndị uweojii sị na ha na-achụ ndị kpara ike n'ike iji zọpụtata ụmụakwụkwọ a. Ndị omekome egbuola ndị agha Niger Ndị agha Niger egburu na ọnwa December 2019 Ndị omekome a na-eche na ha na Alqeada nwere mmekọ egbuola ndị agha iri abụọ na ise na oke ala mba Niger na Mali. Isi mmadụ iri isi na ato n'ime ndị bịara ọgụ a nakwara mụọ na ya bụ mkpa mkpa kpara ụnyaahụ N'Ofesi, Mba Amerịka na Canada na-ebo mba Iran ebubo na ọ bụ ha ji ogbunigwe elu gbatuo ụgbọelu mba Ukraine si ọdọ ụgbọelu ha fepu. Ha sị na ọ bụ na-amaghi ama ka Iran jiri mee ihe mana Iran na-ago si na ha ka na-eme nyocha ihe kpatara ya bụ ụgbọelu jiri daa N'Egwuregwu, Real Madrid and Atletico Madrid ga-ezute onwe ha na mgbacha iko akpọrọ Spanish Super Cup ga-esu ụbọchị Sunday. Atletico jị ọkpọ gọọlụ atọ asatara abụọ merie Barcelona ụnyaahụ ji tozuo" 43819843,https://www.bbc.com/igbo/43819843,Ụlọikpe achụpụla osote onyeisi omeiwu Delta steeti,"Ụlọikpe ukwu dị na Kwale, achụpụla Friday Osanebi bụ osote onyeisi omeiwu nke Delta steeti.","Friday Osanebi dị afọ iri atọ na asatọ bụ onye pekarịchara mpe n'afọ n'ụlọomeiwu ndị Delta steeti Ha kwuru na ha chụpụrụ Osanebi na-anọchite anya ndị Ndokwa East, maka na ọ tụrụ asị banyere onye obodo ọ bụ. Nchụpụ a na-abịa n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọnọdụ osote onyeisi omeiwu afọ atọ. Ọkaikpe V. I Ofezi, gwara ndị Inec ka ha were ọsọ were ije napụta asambodo mmeri ha nyere Osanebi. O kwuru ka ha nye Emeke Odegbe bụ onye otu Pdp ahọpụtara n'ụzọ ziri ezi na ntuliaka 2015 asambodo ahụ. Osanebi nyere ọkaiwu ya ikike iji gbaghaa ikpe a. Ọnụ na-ekwuchitere Osanebi bụ Agbanishi Obinne, gwara ndị ntaakụkọ na ụjọ atụla ha, na Osanebi gbadoro anya nakwa na-agba mbọ igbanwe ndụ ndị ọ na-anọchite." afirika-52577001,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52577001,Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo.,"N'oge gboo, ndị nne na-eji olu ike akpọtụrụ ụmụaka ha kpapụrụ akpapụ gaa igwu egwuregwu n'agbataobi ha maọbụ n'ama egwuregwu.","Ọ na-abụ nwantakịrị nụ olu nne ya, o jiri ọsọ jiri ije laruo ụlọ maka ụtarị. •Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo •Uru egwu ọnwa bara na ọzụzụ na njikọ ndị Igbo •Ekwensu ọ bụ 'satan' n'ala Igbo? Oge ahụ ka ụmụaka mara etu e si enwe aṅụrị na etu e si egwu egwuregwu. Oge ahụ, ndị mmadụ anaghị achịrị obi ha n'aka maka onye agbataobi ha, kama nwa bụ nwa ọha, nwantakịrị ọbụla nwereike ịga n'ụlọ onye agbataobi ya ọbụla soro ụmụaka ibe ya gwurutu egwu. Egwuregwu akarịka nụ, tupe e mee nke a, mee nke ọzọ, chi a na-achọ iji, ụfọdụ oge, ụmụaka anaghị echeta dị na ha eribeghi nri. Ọ dịzị ka ụfọdụ egwuregwu ahụ alachala maka na o nweghizi onye nwere ohere ha ugbua, nakwa egwu abịala ọtụtụ mmadụ, e nweghizi ntụkwasi obi ebe agbataobi nọ. Mana, ọ dị mma ka anyị laghachitu azụ chetara gị ihe ndụ dịka ya oge oge gboo." 57188244,https://www.bbc.com/igbo/57188244,"Unknown gunmen attack : E gbuola mmadụ abụọ n'Oguta, Imo steeti","Mkpu akwa na anyammiri bụ ihe na-afịọ n'obodo Ụmụakụ nke Ejemekwuru dị n'Ugwuta,Imo steeti n'ụzọ ụtụtụ Tozde dịka ndị a mabeghị ndị ha bu egbe gbagburu ndị nche abụọ.","Nwoke na ihe: Nze Ikechukwu Nwaoza, nna ndị nwụrụ na ezinaụlọ ya nọ n'arịrị obi maka ọnwụ Chijioke Nwaoza na Emeka Nwaoza Ụmụnne abụọ; Chijioke Nwaoza na Emeka Nwaozo na ndị ogbo ha nọ ọrụ nche obodo n'abali foro Tọzde(19/05/2021) oge ndị ji egbe bu ụgbọala wakporo ha ebe Elekere Abụọ nke ụzọ ụtụtụ taa,gbawa ha egbe. Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na egbe ahụ tụrụ mmadụ abụọ n'ime ha, ha nwụọ, ebe ndị ogbo ndị ọsọ mere oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ. Nwanne ha bụ Adindu Nwaoza kwuru etu Emeka sịrị nwụọ sị, ""Ọ gara ebe ọ na-eche nche, ndị bu ụgbọala Hilux bata ebe ahụ gwawa ha egbe."" ""Mgbọ tụrụ ya n'isi, ebe ahụ ka ọ nọ kubie ume."" Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu. Mmadụ abụọ ahụ nwụrụ anwụ hapụrụ ụmụ isii, ụmụ isii tupu ha alaa mụọ. Emeka Nwaoza na ezinaụlọ ya Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Elkanah Bala kwuru na ọ nụbeghị maka ya bụ ọdachi man kwuo na ya ga-ajụ ese, ma nyeghachi BBC ozi mana o mebeghị nke a oge akụkọ anyị wepụtara akụkọ a." afirika-45080767,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45080767,NYSC: Mmadụ 9 anwụọla ebe ha na-efe ala nna ha,"Onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Taraba a kpọrọ David Missal, ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị na-efe ala nna ha ruru 9 nwụrụ na mmiri dị na Taraba steeti.","Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha. O kwuru na kemgbe ihe mberede a mechara, na ọ bụ ozu mmadụ asaa ka a gụpụtarala na mmiri ahụ. Missal kwukwara na ihe mere ndị a na-efe ala nna ha ji nwụọ ebe ha na-egwu mmiri bụ na mmiri malitere ito na-akaghị aka. @IsimaOdeh kwuru na ọ bụ ihe nwute na ihe ruru mmadụ 9 ndị NYSC nwụrụ na ya bụ ihe mberede. Ebe @MKIbrahimSenior kwuru na ọ dị mkpa ka akụziere ndị na-efe ala nna na-aga ebe mmiri dị etu esi egwu mmiri. O kwuru na akụkọ ruru ha aka kwuru na ndị na-efe ala nna ha ruru mmadụ 22 gara nlegharị anya na mmiri Mayo-Selbe dị na Taraba tupu ihe mberede a emee. 'Mberede nwa m egbuola m na ndụ' ""A gwakwara anyị na ka ha nọ na-egwu mmiri, mmiri ahụ malitere ito na-akaghị aka."" ""Anyị agụpụtala ozu mmadụ asaa ma na-achọ ozu mmadụ abụọ fọrọnụ."" N'otu aka ahụ, onyeisi ụlọọrụ NYSC bụ Florence Yaakugh kwetekwara na ihe mberede a mere. O kwuru na ya bụ ihe mberede wutere ya na ndị otu ya nke ukwuu ma kwekwa nkwa na ha ga-akpọpụta aha ndị niile ihe a metụtara n'ọha. N'ọnụ ya, ''ihe mberede a e tinyela anyị niile n'iru uju."" Akụkọ ndị ga-amasị:" afirika-47158580,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47158580,Vice President Debate 2019: Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa,"Otu na-achụso ọchịchị ziri ezi, BBC na mba Naịjirịa nakwa TVC gbakọrọ aka hiwe nrụrịtaụka ndị osote onyeisiala na Naịjirịa ụbọchị Fraide.","Lee ihe ndị mere na ya bụ emume: Ndị mere nrụrịtaụka gụnyere; * Rabiu Ahmed Rufai nke AAC * Khadijah Abdulah-Iya nke ANN * Kunle Olateru Olagbegi nke ADC * Yemi Osinbajo nke APC- Ọ bịaghị * Peter Obi nke PDP- Ọ bịaghị * Umma Getso nke YPP- Ọ bịaghị * Shehu Gabam nke SDP-Ọ bịaghị Ndị chịkọtara ya bụ okwu bụ Aliyu Tanko nke BBC na Ngozi Alaegbu nke TVC. Okwu ndị bụ isiokwu na ndọrịtaụka a bụ: * Agụmakwụkwọ * Akụnaụba * Ahụike * Nchekwa wdg. Gwa anyị maka pati gị na ihe ejiri mara pati gị Kunle Olateru Olagbegi nke ADC- Anyị ga-enye ụmụnwaanyị, ndị ọlụsị oke pasent 50 n'ọchịchị anyị. Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Ekwela ka onye ọ bụla gwa gị na Naijiria agaghị agbanwe- Naijiria ọhụrụ. Okwu nchekwa Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-eji teknuzu were na-ebuso nsogbu nchekwa agha. Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Ndị mmadụ anaghị arụzi ụra n'abali. Anyị kwesiri ijkọta aka anyị na mba ndị dịka Amerịka. Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- O kwesịrị na anyị na mba anyị na ha gbara agbataobi jikọrọ ọnụ na ọrụ ichekwa mmiri na ala dị na agbata any Naijiria na mba ndị ọzọ. Nsogbu nchekwa na Zamfara Rabiu Rufai- Steeti ahụ bụ steeti ndị otu APC, minịsta nchekwa sikwa na steeti ahụ. Ihe na-eme ahụ gosiri na ha adaala n'ọrụ ha. Ị ga-agba ọtụtụ kilometa na steeti ahụ ịgaghị ahụ otu onye uweojii. Ọ bụghị ihe dị mma n'ihi na ndị omekakome ji maka ọlaedo dị n'ime ala na steeti ahụ na-enuba na ya. Khadijah Abdulah- Iya nke ANN - Anyị agbahapụla etu anyị si echekwa onwe anyị n'ime obodo. Onye bịa obodo ọhụrụụ ọ ga-hụ eze obodo. Anyị ga-alaghachị n'omenala ahụ. Anyị na ụlọọrụ ndị mba ọzọ ga-ejikọta ọnụ n'ikwalite ọrụ nchekwa dịka o si gbasa ike ndị omekataraihepụụjọ na-akpa. Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị ga-eji obodo ichekwa onwe ha, mkparịtaụka na aka ike were busoo nsogbu nchekwa agha. Ụgwọ ọnwa opekatampe Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị ga-ebulite ụgwọọna opekatampe rue N100,000. Rabiu Rufai nke AAC -Anyị bụ ndị bụ ụzọ kwube okwu ka eme ụgwọọna opekatampe N100,000. Ọ bụrụ na-iche ego nri kwa ụbọchị onye ji ụmụaka anọ -na-eri N1000 kwa ụbọchị n'abali iri atọ, ha ga-etinye N30,000 naanị n'iri nrị. Gọọmenti ochie wepụtara Napep,Sure-P. Goomenti ugbua wepụtara Tradermoni. Kedu atụmatụ ụmụ ga-ewepụta? Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị kwesịrị ịbụ isiobodo ebe ana-ewepụta gaasị. Ọ bụghị na ịtaghị ndị na-ezu ego obodo ahụhụ ,ha aghaghị akwụsị ya. Anyị ga-apịchị ebe niile e si ezupu ego, were ego ndị a tinye n'ọrụ. Rabiu Rufai nke AAC- Ihe anyị na-ahụ ugbua bụ iji ego na-azụ vootu na-akpọ ya 'Tradermoni. Ọ bụrụ na ha chọrọ ime ya ha kara ime ya gwa gwa ha banyere n'ọchịchị. Ibi ego Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Ọ bụ amaghị eme mere na a na-eje ebiri ego nke ga-etinye ndị amụbeghị amụ n'ụgwọ n'ala anyị. E kwesiri ịna-akpụpụ ndị na-ebi ego aghara aghara ụlọikpe. Agụmakwụkwọ Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị kwesịrị ịhaziharị kụrịkọlụm. Anyị ga-ebidokwa ịkwado nchọpụta iji wulite mmepụta ngwahịa. Ndị chịbụrụ etinyeghị uchu n' agụmakwụkwọ ya mere agụmakwụkwọ jiri kpụọ afọ n'ala. Khadijah Abdulah-Iya nke ANN-Anyị ga-akwalite agụmakwụkwọ n' ụlọakwụkwọ Praimarị nke ọha. Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-etinye pasent 10 Bọjeti n'agụmakwụkwọ. Ahụike Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Anyị ga-etinye pasent 10 Bọjeti n'ahụike. Anyị ga-ahụ na onye ọbula nọ n'atụmatụ ahụike 'health insurance.' Kunle Olateru Olagbegi nke ADP-N Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-etinye ego n'ahụike. 160,000 Praimarị health workers na ọkpụrụ ọchịchị 774 dị na Naijiria. Anyị ga-akwalite ọnọdụ ọrụ ndị ọrụ ahụike(dọkịta na ndị ọkamara n'ọgwụ)ka ha ghara ị na-agbapụ ala bekee. Akụkọ ga-amasị gị:" 47705955,https://www.bbc.com/igbo/47705955,Oyetola ka ga-anọkwa n'ọkwa ruo mgbe Ụlọikpe kpebiri - Agbakoba,Ọnọdụ Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọrọtọ PDP were mee ntuliaka nke ndị Gọvanọ n'Osun steeti gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya ụgbụa.,"Adeleke gosiri na obi adighị ya etu esi nara ya mmeri ya Ebe ọtụtụ na-asị na ya bụ mmeri Adeleke meriri n'ụlọikpe ehibere maka ikpezi okwu dapụtara n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ekwuchaa ọgwụ. End of Twitter post, 1 Osun Election: Ụlọikpe enyela Adeleke mmeri Ụlọikpe achụdala sinetọ Aidoko Nke bụ na onweghi ihe ọ fọrọ ka ya bụ nwanne nna Davido rigoro na ọchịchị. Ụfọdụ na-ekwu na ụlọikpe ikpe mkpegharị nke Adegboyega Oyetola APC wegara ya bụ ikpe nwere ike ịtụgharị ya. Osun Decides: A ga m anara APC mmeri m n'ụlọikpe - Adeleke BBC Igbo kpọtụrụ okaikpe ukwu bụ Olisa Agbakoba ịmata ka ihe siri kwụrụ na ya bụ okwu. Agbakoba kwuru n'ezie na Adeleke meriri ya bụ ikpe na ụlọikpe, mana Oyetola ewegala ya bụ okwu na ụlọikpe mkpegharị. Olisa Agbakoba (SAN) O kwuru na ""iwu nyere Oyetola ohere ịnọ na ọkwa dịka Gọvanọ Osun steeti ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-ekpebi ya bụ ikpe."" Ọ sịkwa na ọ bụrụ na ya bụ Oyetola emerie na ogogo ahụ na ọ ga-achiri gawa ruo mgbe ọ chizuru afọ anọ ya. Akụkọ ga-amasi gị Lee ihe nkiri anyị Ndị ụlọomeiwu Imo steeti a họpụtara ọhụrụ aga-enye Emeka Ihedioha aka n'ịkwalite ọchịchị steeti?" afirika-44213488,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44213488,Aka akparala dọkịta ghọrọ yahoo-yahoo,Saa anya mmiri ka isi e ji ịntanet ezipụ ego gi dị n' obaego iji gbalahụ ngaramara.,"Thompson Williams dị afọ iri abụọ na asatọ bụ dọkịta gbaghara ọrụ nleta ahụike ya bụrụ 'hacker' Dịka otu onye ji intanet ezupụ ego ndị.mmadụ dị na ọbaego nke akpọrọ'hacker' na bekee gbara ama, ụlọakụ ndị nọ n'ala Naijiria enweghị ezi nchekwa dịka ndị mba ofesi nke mere na ọ dị mfe mmadụ nwere nka intanet izubu ego site n'ọba egọ ndị ahụ. Nɗị uweojii nwụchiri Michael Thompson Williams maka iji nka iṅtanet zụọ ụgbọala Porshe dara nde naira iri abụọ na ise ma mee ka onye ọ zụrụ ahịa nweta 'alert' na adịghị ego ọbụla ọ kwụnyere ya. Onye ọ zụrụ ahịa bụ Abiodugun Adewale wegara ndi uweojii mkpesa ha were chọwa nwa amadị ɓụbu ɗọkịta ma nweta ya na Lekki, dị na Legos. Thompson onye rụburu ọrụ n'ụlọọgwụ ndị nwere agba na Legos tupu ọ ga biri na Canada kọwara ndị ntaakụkọ ka ya si eji nka intanet enyopụta oge ndị nnukwu mmadụ jị ezipụ egọ na ịntanet ma jiri nka ya ɗobiri ego ka o siri masị ya. Williams na-eji ego o nwetara na 'credit card' ya zụọ ụgbọala na 'software' dị iche iche Williams onye kwupụtara na ya ezuola ego onye ihe nkiri Amerika ama ama bụ John Travolta ọtụtụ mgbe sị: "" Onye ọbula bụ hacker bụ ụlọaƙụ nye onwe ya. I nwere ike izupu ego nɗi mmadụ nwere n'ọbaego ha were ya zụo ihe masiri gị n' ụlọahịa ɗi nanintanet. John Travolta na-ezipụ nnukwu ego kwa izuụka. A dọbitala m ego ya ọtụtụ mgbe ma nwere ya zụọ ngwa 'software' ndị nji amụtawanye nka m ."" Gere ihe okwuru ebe a: Ihe Williams Thompson kwuru Onyeisi ndị uweojii bụ Imohimi Edgal kwuru na ha ga-akpụpụ Williams ụlọikpe ma ha mecha nyocha. Ọ tụrụ arịrị na nwoke ahụ ɗị afọ iri abụọ na asatọ ji nka ya eme mpụ ma ɗọọ ndị omekeome ṅọ na Legos aka na nti si ha chọrọ ezi ọrụ. Akụkọ ga-amasị:" media-46441794,https://www.bbc.com/igbo/media-46441794,2019 Elections: Ndigbo e nwere ọnụ okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Lagos?,"Dika 2019 tụnyerela n'ụkwụ, ndị na-azo ọkwa ọchịchị na Legọs steeti tinyere anya na mmiri were na-achọ ihu Ndigbo site n'achụmnta vootu ha.","I legharịa anya, ị hụ na ọtụtụ ha na-eyi akwa isiagụ aga mmemme dị mkpa, ebe ụfọdụ yi ya mee ozi achụmta vootu ha. Otu onye ọrụ mgbasaozi achụmnta vootu nke Babajide Sanwo-Olu bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bu Gboyega Akosile gwara BBC Igbo na ihe mere ha jiri tinye Ndigbo n'obi n' ozi achụmnta vootu ha bụ na ''Ndigbo adika mkpa mmadụ ịgba nkịtị n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Legọs."" Ndigbo e nwere ọnụ okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Lagos? Otu onye Igbo ọnụ na-eru n'okwu bụ Goddy Uwazuruike kwuru na ndị na-eme Ndigbo 'mụ na gị nọ' bụ n'ihi na Ndigbo nwere ọnụọgụgụ. Uwazuruike, onye bụbu onyeisi otu Aka Ikenga, si: ""Onye ọbụla kpọrọ Ndigbo asị si na ọ gaghị echeta ha n'oge ntuliaka bụ onye amaghị ihe n'ihi na Ndigbo nwere ọnụọgụgụ."" Ọ tụrụ arịrị sị na ọ bụ ""naani na ntuliaka ka a na-echeta Ndigbo ma na Legọs ma n'etiti."" Onye mere Ndigbo agbọghọ okorobịa niile na-achụ? Nke a bụghị mbụ a na-achọ ihu Ndigbo n'okwu ndọrọndọrọ Legọs. Lee ihe isii na-atu aka na nke a: 1. Ndigbo bi na Legos bara ụba ka mkpụrụụgbaka Ọchịchị onyekwuoucheya bụ egwu onye ka n'ọnụọgụgụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na Ndigbo bi na Legọs karịrị pasent iri atọ n'ime mmadu ruru nde 20 bi na Legọs. 2. Na Ntuliaka 2015, na Legos, Muhammadu Buhari , onye zoro okwaonyeisiala n'aha APC jiri naani 160,133 (vootu 792,460) karia Goodluck Jonathan nke PDP ,onye nwetara vootu 632,327. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ nkwado Ndigbo nyere otu PDP mere ka vootu Jonathan gbalite. 3 .N'afọ 2015, Ndigbo atọ nwetara ohere ịnọchitempaghara Legos ụfọdụ n'ụlọomeiwu nke etiti nakwa nke Legọs steeti nke gosikwara na onye gbara Igbo nkịtị bụụkpala okpoko gburu. Rita Orji(Ajeromi-Ifelodun) na Tony Nwulu (Oshodi- Isolo) n'ụlọomeiwu nke etiti n'aha PDP, ebe Jude Idimogu(Oshodi/Isolo) nwetara n'ụlọomeiwu nke Legọs. 4. Ịhụta Ndigbo dika 'ọbịara-mba-kpara ala' mere Eze Legos, Oba Rilwan Akiolu, ji majaa Ndigbo na 2015 si ha tụnyere Akinnwumi Ambode nke APC, emeghi otu a, a tụba ha na mmiri. Mana o mechara ọ rịọ mgbaaghara. 5. Iji nye Ndigbo mụọ na ha sokwa n'ihe a na-eme mere ka gọọmentị Legos ji nye ụfọdụụmụafo Igbo ọkwa ọchịchị Ndị dịka Joe Igbokwe, ọnụ na-ekwuru APC na Legọs nakwa Ben Akabueze, onye bụbu Kọmishọna mkpata na mmefu ego. 6. N'oge Zik, oge pati NCNC chị ọgbọ, ụfọdụ Ndigbo meriri na ntuliaka na Legọs. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50205502,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50205502,Insurance in Nigeria: Uru dị n'ikpuchi azụmaahịa gị maka ọdachi,"Igbo tụrụ ilu sị 'Agha a gbara ama ya, a dịghị eri nwa ngwọrọ', nke a bụ ka ọ dị n'ihe banyere ikpuchi akụnaụba (Insurance) mmadụ maka ọdachi.","Akụkọ a kọwara uru dị nakwa usoro onye azụmaahịa ọbụla nwereike iji chekwaa ngwaahịa ya maka ọdachi ndị gụnyere ọkụ ọgbụgba, mmiri oriri maọbụ izu ya n'ohi. Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ gbara n'ahịa Ọchanja, Ọnịcha n'izuụka gara aga. Otu onye ọkacha n'okwu banyere ikpuchi akụnaụba bụ Golden Akukwe, kọwara uru ndị a ma nye ntuziaka etu e si eme nke a. Ọ sị na uru gbara ọkpụrụkpụ dị na mmadụ ikpuchi azụmaahịa ya bụ na ụlọorụ na-ahụ maka nke a (insurance company) ga-akwụghachị ya ụgwọ ngwaahịa ndị ahụ ma ọ bụrụ na ihe mee ha. O nyere ndị na-achụntaego ndụmọdụ ka ha gbalịa kpuchie ngwaahịa ha maka 'ihe Ọnịcha gwara Obosi'. Akukwe sị na ọ hụbeghi ọghọm dị na mmadụ ikpuchi ngwaahịa ya ma ọ bụrụ na onye ahụ mere ya n'ụzọ ziri ezi. Kedụ usoro mmadụ ga-eji kpuchie azụmaahịa ya? Golden Akukwe onye ọkacha n'okwu ikpuchi akụnaụba (Risk Manager) Akukwe kọwara ụzọ onye azụmaahịa nwereike iji kpuchie ngwaahịa ya maka ọdachi. Ọ sị na onye ahụ ga-eme ihe ndị a; Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Onitsha fire: ""Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?" afirika-50055795,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50055795,Aisha Buhari vs Mamman Daura: Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock,O nwere ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi otu nwaanyị nọ n'ime ụlọ na-aba mba ka e mepeere ya ụzọ.,Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya Ọ pụtara mgbe akụkọ asịrị na-ekwu na onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ maka na nwunye bụ Aisha anọghị ya kamgbe ọnwa atọ. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-asị na nwaanyị ahụ bụ Aisha na-eti mkpu mgbe ndị ọrụ onyeisiala jụrụ imepere ya ụzọ. N'ihi ya Aisha Buhari apụtala gwa ndị ntaakụkọ na ọ bụ ya nọ n'ihe onyonyo ahụ kama na ọ dịla anya ihe ahụ mere. Ọ sị na ọ bụ nwa nwanne Buhri a na-akpọ Fatima Mamman Daura sere ihe onyonyo a. Ọ gara n'ihu kwuo na onweghi ihe e mere nwaada a n'ihi na ọ bụ nwa Mamman Daura bụ nwanne nakwa onye ndụmọdụ onyeisiala Buhari. Fatima Daura kwetara na ọ bụ ya sere ihe onyonyo ahụ mgbe Aisha Buhari chọrọ ịwakpo ha n'Asọ Rock. Gịnị na-ese okwu? Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari sị na Fatima nọ na-achị ya ọchị n'ihe onyonyo ahụ o sere n'ihu ndị ọrụ nchekwa ya. O kwuru na ọ bụ maka na onyeisiala sịrị ha kwakọrọ pụọ n'ụlọ ha bi ka nwa ya nwoke kwabanye. Aisha sị na ọ chọrọ ịbanye n'ime ụlọ ahụ mana a gbachiri ụzọ ya agbachi. Mana Fatima sị na ihe onyonyo a bụ ka o gosi nne na nna ya ụdị agwa Aisha kpasoro ya n'oge ahụ. Ọ sị na mkpu Aisha nọ na-eti tụrụ ya egwu na ọ hụtụbeghi ihe dị etu ahụ. Cheta na nke a abụghị mbụ Aisha Buhari na-ekwu okwu banyere mmegbu ọ na-enweta n'Asọ Rock. N'oge gara aga ọ pụtara n'ihe onyonyo kwuo na o nwere ndị nọ n'Aso Rock 'na-akụrụ onyeisiala Buhari egwu ọ na-agba'. Akụkọ ga-amasị gị: afirika-54412259,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54412259,Aston Villa vs Liverpool: A kọọla Liverpool ka ncha nkọta,Aston Villa gwọrọ Liverpool nnọọ ọrịa ji ha site n'iji ọkpụ goolu asaa asatara abụọ merie ha n'asọmpi Premier League.,"Goolu malitere izu ka mmiri n'elu ụlọ ndị Liverpool na nkeji 4' mgbe Ollie Watkins nyere goolu mbụ. Liverpool ka che na Aston Villa bịara ihe egwuregwu mgbe nwa amadị a nyere goolu nke abụọ na nkeji 23'. Mana Mohammed Salah kpotere ndị Liverpool n'ụra site na goolu o nyere na nkeji 33'. Na-egbughi oge John McGinn nke Aston Villa sụnyere goolu nke atọ ya na nkeji 35' iji gwa Liverpool na sụrụgede abụghị egwu ụmụaka. Tupu Liverpool ekuru mmiri tọgbọ ike Ollie Watkin mezuru ya goolu anọ na nkeji 39', bụ goolu nke atọ ọ na-enye n'asọmpi a. Dịka ọkara nke abụọ malitere, Ross Barkley nke Aston Villa ji goolu ọzọ nabata Liverpool na nkeji 55'. Mohammed Salah zaghachịrị ha oku a na nkeji 55' site n'inye goolu nke abụọ ndị Liverpool. Mana o mere ndị Liverpool vuum n'anya ka ndị mgbe Jack Grealish nyere goolu ọzọ n'aha Aston Villa na nkeji 66'. Liverpool chere na ụka agbasala mana Aston Villa ji goolu ọzọ s n'aka Grealish na nkeji 75' nke asaa gwa ha na 'onwebeghi ihe ị hụrụ gị na-akpọ kashị'. Ụdị mmeri a ga-abụ mbụ a na-eji etu a emeri otu egwuregwu mabutere iko Premier League. Ọ ga-abụ nke mbụ a na-eji goolu ruru asaa emeri otu Liverpool kamgbe afọ 1968 (afọ 57 gara aga), mgbe Tottenham meriri ha. Tottenham amịkpọọla Man United n'anwụ ka azụ Mangala Tottenham mere Manchester ụra aga n'anya n'asọmpi Premier League site n'iji ọkpụ goolu anọ asatara otu merie ha. A kwọbeghi 'beans' n'asọmpi a mọị mọị malite isi na nkeji 2' mgbe Bruno Fernandes ji penariti nye goolu mbụ ndị Man U. N'otu ntabi anya ahụ Tottenham gwara Man United na ha abịaghị ịchị ma saa goolu a site n'aka Tanguy Ndombele na nkeji 4'. Tupu Man United amata nke ekwe na-akụ Tottenham mezuru ya goolu abụọ na nkeji 4', nke Heung-Min Son nyere. O kpu pịpịrọ ji akwụkwọ ọbara ọbara chụpụ Anthony Martial na nkeji 28' maka ịma onye Tottenham ụra. Nke a nyere ndị Tottenham ohere iji ndị Man United gwuo egwo ka ụmụaka na-amụ amụ. Na nkeji 30' na 37', Tottenham yere goolu abụọ site n'aka Harry Kane na Heung-Min Son iji mee ya goolu anọ. Ka ọkara nke abụọ malitere, Serge Aurier mezuru ya goolu ise na nkeji 51'. Tottenhma malitere iji Man United agba okoso nke mere Paul Pogba ji gbara penariti na nkeji 79' nke Harry Kane nyere goolu ya. Mmeri a tụrụ ndị Man United n'anya maka na ọ bụ n'ụlọ ha ka Tottenham bịara tie ha mmanwụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44897365,https://www.bbc.com/igbo/44897365,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: PDP a ga-eso eme ntuliaka 2019?,Isiokwu ndị dị mkpa n'ụtụtụ a Gbasara PDP na ntuliaka 2019,"Site n'ọnụ onyeisioche ha bụ Uche Secondus, ndị otu PDP ekwuola na ha nwere ike ghara isonye na ntuliaka a ga-eme na 2019. Secondus kwuru na ntuliaka e mere n'Ekiti mere ka okwukwe ha nwere n'ime otu Inec fuo. O kwukwara na ihe Inec na-eme edoghị ha anya, na ha amaghị ma ha a ga-arụnwu ọrụ ha na-enweghị ihu abụọ. Okonjo-Iweala na Twitter Ihe ọma emeerela nwaafọ Igbo bụ Ngozi Okonjo-Iweala, ka Twitter mere ya otu n'ime ndị isi oche. Ngọzị sara sị na obi dị ya ụtọ Na mba ofesi, Anwụchiela dọkịnta Denis Furtado bụ onye gburu nwaanyị ukwu sara mbara na-adị mma gakwuuru ya inweta otele ukwu. A ga-ekpe ya ikpe dịka onye ma ụma gbuo mmadụ. Dọkịnta Furtado sị na ọnwụ nwaanyị ahụ dị nwute Gụọ ya n'uju ebe a: Dọkịnta Bumbum: Aka akparalanụ dibia otele ukwu Ebe ụgbọmmiri bu ihe ruru mmadụ iri atọ na otu dara mmiri ma gbuo mmadụ asatọ n'elu mmiri Missouri dị na mba Amerịka. Ndị Naịjirịa nọ na Rọshịa Ozi anyị nwetere n'abalị ụnyaahụ kwuru na ụgbọelu gọọmentị Naijiria zigara mba Rọshịa ibulata ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ eruola, ebe ihe karịrị otu narị bụ ndị mbụ n'ime ha eruola ọdọ ụgbọelu ịkwado maka ịlota Naịjirịa taa. Cheta na mmadụ karịrị 200 tọrọ atọ na Rọshịa dịka emechiri asọmpị Iko Mbaụwa na Rọshịa ụbọchị ole na ole gara aga. Ụfọdụ kwuru na e gwuru ha wayo n'ikagbu akwụkwọ njem ha bụ 'ticket' na bekee n'agwaghị ha. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọtụtụ mmadụ n'ime ndị tọrọ na Russia ga-alọta taa N'egwuregwu Otu Liverpool esila n'aka ndị AS Roma zụọ ochee goolu Alisson, nke mere na ọ bụzị oche goolu kacha adaọnụ n'ụwa. Alisson bụ oche goolu so Brazil gaa asọmpi Iko Mbaụwa 2018 Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Nwata a mịrị paịntị ọbara anọ n'otu ọnwa." afirika-46719978,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46719978,Enugu accidents: Ọdachi a ataala isi 15,"Ka a na-abanye afọ ọhụrụ, ọkụ atapịala keke abụọ ya na ọdọ ebe a na-ere gas eji esi nri n'okporo ụzọ Nike Lake nke dị n'Enugu.","Ọkụ agbaala ọdọ gas n'Enugu Dịka a na-achọ ihe bidoro ya bụ ọkụ, akụkọ kọrọ na ndị uweojii na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ kere nkwụcha ebe ahụ maka ịgbochi ihe ntụmadị ndị ọzọ nwere ike ị dapụta. Ndị ọlụọọla Niger Delta ga-amalite ọgbaaghara ọzọ Niger Delta Avengers chiri ochi ka gọọmentị Naịjịrịa tee nkwucha, maa chee aka ghọrọ ha mgbe adighị anya Otu jikọrọ ndị ọlụọ ọla na Naịja Delta ekwuola na ha ga-amalitekwa ọgbaaghara ọzọ n'igosi iwe ha maka na gọọmenti etiti emejuputaghị nkwa ha kwere. Ọnụ na-ekwuru ndị otu a bụ General Christ kwụrụ na ndị otu a gụnyere Niger Delta Creek Warriors, Ogunuma Camp of Niger Delta, Niger Delta Republic Seekers na Niger Delta Revolutionary Crusade sị na ha gwa ọha maka ya. Ndị mmadụ ji ọkụ ekwentị ha ahụ ụzọ maka ntuliaka N'ofesi, gọọmentị DR Kongo emechiela ọbaozi intanet na ụfọdụ obodo ha kemgbe ha mechere ntuliaka onyeisiala n'izu gara aga. Onye sọ na ya bụ ntuliaka bụ Martin Fayulu sị na gọọmenti ma ụma mechie ya bụ obaozi ka ndị mmadụ ghara ịmata onye meriri n'ezie. Serena na Roger ga-akwata n'iko hopman tenis Serena Williams na Roger Federe weriri asọmmpi Wimbledon na 2012 Ndị uweojii Enugu steeti ekwuola na ihe mberede mere n'ụzo Enugu-Abakaliki ụbọchị Monde ataala isi mmadu ise. Ọnụ n'ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu kwukwara na ihe mberede a gburu ehi iri na ise, ma meruo mmadụ itoolu ahụ. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile O kwuru na ihe mberede a mere ebe elekere ise nke ụtụtụ, ka nnukwu ụgbọala bu ehi gbapụrụ n'ụzọ ebe ọ na eze ụgbọala mebiri emebi n'ụzọ. Ndị uweojii na-agba mbọ ikpochapụ ụgbọala ndị ahụ mebiri emebi ma hụkwa na ụdị ihe a agaghi emezi ọzọ. Amaraizu kwuru na ihe mberede ọzọ mere na Enugu egbughị onye ọbụla. Ihe mberede a gụnyere ọgbụgba ọkụ ụgbọala bu gas eji esi nri nakwa ọgbatumtum abụọ na otu ụgbọala n'ụzọ Isuoba lane dị n'Enugwu. O kwukwara na onweghị onye tufuru ndụ ya na ya bụ ọdachị makana ya na ndị otu nakwa ụlọọrụ na-emenyu ọkụ bịara ozigbo menyụọ ọkụ ahụ. Unicef kwuru sị na ihe ruru ọkara ụmụaka amụrụ n'ime afọ ọhụrụ a ga-anwụ Ụlọọrụ n'ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ UNICEF agbala afa na-aga amụta ụmụaka dị ọnụọgụ dị puku iri abụọ na ụma echi bụ ụbọchị mbụ n'afọ 2019 na Naịjirịa. Dika Onye nnọchite anya ndị otu a bụ Pernille Ironside sị kwụọ, ihe karịrị ọkara ụmụ aga amụ n'ụwa sitere na mba asatọ nke Naịjirịa na India chịtara ezigbo aja na ha. Ndị agha Naịjirịa agbalara ndị obodo Baga dị na Borno steeti ama ka ha kwapụ kwapụ na be ha maka agha ha chọrọ ịbuso ndị ọlụọla Boko Haram. Onye gbara ama a bụ Col. Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjịrịa n'akwụkwọ ọ degara ndị obodo ahụ. APC napụrụ PDP ọchịchị n'afọ 2015 Ndị ndu otu pati APC etiela mkpụ maka ajọ nkata ụfọdụ mmadụ na-akpa maka ị sepụ ndị Igbo ọnụ n'ara maka ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa na 2023. Onye gbara ama a bụ osote onyeisi oche pati ahu na ọdịda anyanwu bụ Emma Enekwu bụ onye si na ndị ọnụ na-eru n'okwu na agbakeri ala ịma ka aga esi kwọọ ya bụ onye ukwu wara. Sheikh Hasina emeriela ịbụ onyeisiala Bangladesh Prime Minista ndị Bangladesh bụ Sheikh Hasina enwetela mmeri ọzọ na ntuliaka ha mere na mba ahụ agbanyeghị na ọ sị na ka ya bụ ntuliaka siri gaa ejucheghị ya afọ. Paul Pogba gosiri ihe ojiri bụrụ onye akpu n'ọnụ N'egwuruegwu, Pogba bụ okwu akwụ n'ọnụ na twitter tata bụ Monde. Akụkọ na-ekwu na Paul Pogba abụrụla onye mbụ na Manchester United bụ onye nyere opeketempe goolu abụọ n'asommpi abụọ sochi ibe ya azụ kemgbe Disemba 2012. Gee akụkọ anyi na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze'" egwuregwu-50386382,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50386382,Nigeria Vs Benin: Ugo Nigeria atụgbuola ọsa Benin Republic,Ndị Super Eagles nke Naịjirịa gosiri na ha ka sokwa n'ihe a na-eme ka ha ji goolu abụọ a satara otu merie Bene Repọblik.,"Mgbe Omeruo nyere goolu n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke a gbara n'Ijipt N'asọmpi e ji akwado ntozuoke ndị ga-eso sọọ mpi Iko Mba Afrịka nke 2021 a gbara n'ọgbọegwuregwu dị n'Uyo, Akwa Ibom steeti, ndị Super Eagles ekweghị ezu ike ruo mgbe ha nwetara mmeri. Stephane Sessegnon nke Bene bu ụzọ dọpụta ọbara ka o nyere goolu na nkeji atọ e ji malite bọọlụ. Mana goolu Victor Osimhen ji penariti gbanye na nkeji 45 iji saa ya na nke Samuel Kalu nyere na nkeji 63, zuru iji gwa ndị Bene bụ ọbịa ha 'kwakọrọ lawa'. Mmeri ndị Super Eagles abụghị naanị ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ makana ụfọdụ ihe na-atọ ọchị mere maka ndị na-egere egere. Ọmụmaatụ bụ etu onye na-akọwa ihe na-eme n'ọgbọegwuregwu si kwuo na Alex Iwobi ka na-agbara Arsenal bọọlụ kama Everton. Ọzọ tọrọ ọchị bụ etu onye ahụ sikwa kwuo sị: ""Super Eagles 2, Naịjirịa 1"". Mana ọ ghọtara onwe ya, rịọ mgbaghara maka nkwuhie o kwuhiere. Ọzọ bụ na etu ha si lee bọọlụ n'elu ihe onyonyo amasịchaghị ha. Ọtụtụ kwuru na etu igwe na-ese foto si na-eseta ọgbọegwuregwu ahụ nakwa ihe na-eme n'ime ya, dị ka nke ndị mgbe ochie. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" afirika-47016392,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47016392,Agwọ atụọla nwanyi n'ike n'ulo mposi,"Otu nwaanyị bu aka n'otele ka agwọ tụrụ ya ebe ọ chọrọ ịga mposi n'ụlọ, n'Ọstrelia.","Ha kpọkuru onye maara anya agwọ ka ọ bịa wepụ agwọ ahụ Dịka onye wepụtara agwọ ahụ si kwuo, Helen Richards dị afọ 59, chọrọ ịga mposi n'ụlọ otu onye ezinaụlọ ya ọ gara ileta, oge agwọ ahụ selitere isi wee tụọ ya ka ọ bụ onye o ji ụgwọ. N'ihi na agwọ ahụ enweghi elo n'ime ahụ ya, ihe a gwọrọ Richards bụ naanị ebe eze agwọ ahụ tụpuru. Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị ""otu ihe metụtara m ka m tukwuru ala, m malie elu ka mmọnwụ a na-akwa aka, peteri m wụsa n'ala, m wee hụ ihe yiri mbe olu ya toro ogologo ka ọ na-amaghachị n'ime mmiri."" Jasmine Zeleny bụ ọkachamara n'ihe gbasara agwọ, kwuru na ọ bụ mmiri bubatara agwọ ahụ n'ụlọ mposi ahụ Jazmine Zeleny bụ onye nwụchiri agwọ ahụ kwuru sị na ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ agwọ n'ime mposi ọkachasị oge ihuigwe dị ọkụ, makana agwọ ga na-achọ ebe mmiri dị. O kwukwara na ọ bụ ụjọ mere agwọ ahụ ji makwasị Richards, makana ọ nọchiri ebe o kwesịrị isi pụọ. Agwọ ndị a akpọrọ ""carpet snake"" anaghị enwe elo, mana ndị ọkachamara na-akọwa na ọ na-aka mma ịgba ọgwụ tetanụs iji gwọọ onye ọ tụrụ. O nweela oge oke ọkụ ihuigwe gburu ọtụtụ ịnyịnya, ụsụ nakwa azụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45357712,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45357712,Uefa Champions League: Ndị ga-ezute ibe,"Ka Uefa mechara nhọpụta e ji ama otu egwuregwu bọọlụ tozuru ịba ọnwa ọhụrụ na Champions League, lee ndị ga-agba ibe ha.",Cristiano Ronaldo ga-eso ndị Juventus bịa asọmpi Uefa Champions League nke 2018/2019 Cristiano Ronaldo ga-ezute Manchester United ọzọ; otu ọ gbabuuru bọọlụ ma bụrụ ebe ọ nọ bulie iko Champions League ya nke mbụ. Ndị Paris Saint-Germain ga-ezute Liverpool ebe Barcelona ga-anabata Mauricio Pochettino na ndị otu ya bụ Tottenham na Camp Nou. Ndị ga-ezute ibe N'otu A ATLETICO MADRID BORUSSIA DORTMUND MONACO CLUB BRUGGE N'otu B BARCELONA TOTTENHAM PSV EINDHOVEN INTER N'otu C PSG NAPOLI LIVERPOOL RED STAR BELGRADE N'otu D LOCOMOTIV MOSCOW FC PORTO SCHALKE GALATASARAY N'otu E FC BANYERN MUNCHEN SL BENFICA AFC AJAX AEK ATHENS N'otu F MANCHESTER CITY FC FC SHAKTAR DONETSK OLYMPIQUE LYONNAIS TSG 1899 HOFFENHEIM N'otu G REAL MADRID CF AS ROMA PFC CSKA MOSKVA FC VIKTORIA PLZEN N'otu H JUVENTUS FOOTBALL CLUB MANCHESTER UNITED FC VALENCIA CF BSC YOUNG BOYS afirika-50244980,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50244980,Abịa Security: Kedu ndị bụ ndị 'catcham' a na-eze eze n'Aba?,Ụfọdụ ndị bị n'Aba nke dị na Abia Steeti na-ekwu maka ndị ha sị na ha na ndị uweojii na-arụko a kpọrọ ndị 'Catcham'.,"Otu onye bị n'Aba gwara BBC na ndị a bụ ndị na-agbara ndị uweojii ama. Ọ gwara anyị na ihe eji bido kpọwa ha 'catcham' bụ make etu ha na ndị uweojii sị arụkọ. Ọ kọwara na ha nwere ike bia soro ndị mmadụ nọrọ, mgbe ndị uweojii biara si 'catcham' ha na-anwụchi onye ha chọrọ inwuchi nyefee ndị uweojii. Ihe ndị otu ""Civil Liberties Organisation"" nwere ikwu Onyeisi ndị otu na-ahụ maka ikike dịrị onye bụ 'Civil Liberties Organisation' (CLO) nke Aba bụ Okechukwu Orji gwara ndị BBC ebe ha kwu maka ndị 'catcham'. Orji kwuru na e nwere ndị dịka ndị 'catcham' n'Aba. Dịka o siri gwa BBC na ndị a malitere igbara ndị uweojii ama na nzuzo. Kama ndị mmadụ mechara mara ndị ha bụ. Orji kwuru na n'ebe dịka 'Overail' n'Aba, ha na akwụ n'okporo ụzọ. 'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa' O kwuru na ị hụ mmadụ atọ kwuchiri ụzọ, mmadu abụọ n'ime ha na abụkari ndi 'catcham' ebe otu onye ga-abụ onye uweojii. Ọrji gwagwara BBC na ndị catcham na anapụ ndị mmadụ ego ma sịkwa na ha na ndị nchekwa ndị ọzọ na-arụkọkwa. O kwuru na n'Ụmụikaa 'Junction', na ndị 'catcham' na-anata ndị na-akwọ ụgbọla ego ha na-enye ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ. Ihe gọọmentị Abia steeti nwere ikwu Onyebuchi Ememanka Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na gọọmentị Abia steeti enwetabeghị mkpesa ọbụla maka nke a. Ọ kwukwara na ndịuweojii nwere ikike iji ụzọ kwesiri ekwesi were cheekwa obodo. Ihe ndịuweojii kwuru BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steet bụ Godfrey Ogbonna mana ọzaghị. Anyị kpọkwara Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abụja mana ọzakwaghị. Ogbonna azaghachikwaghị ozi anyị zigaara ya n'akara ekwentị. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkịri ga-amasị gi Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ" afirika-43396472,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43396472,NLC si na ego nrite ndị omeiwu ga ebu Naịjirịa aka,Nigeria Labour Congress ekwuola na nde naira 13.5 ndị omeiwu ukwu Naịjirịa na erị n'ọnwa a gaghị ekwe omume chacha.,"Peter Ozo Esan bụ odeakwụkwọ ndị NLC si na nnukwu ego ndị NASS na erị n'ọnwa na-ebụisi Ọ bụ Shehu Sani na anọchite anya ndị Kaduna sentral na ogbakọ omeiwe ukwu gbara ama nrite a mgbe okwuru na ha na-eri nde naria 13.5 n'ọnwa, na-abụghị ụkwọ ọwa ha. Odeakwụkwọ ndị NLC bụ Peter Ozo Esan, kwuru na ọ bụ ihe ihere na ọ na obodo ọpekatampe ndị ọrụ bụ 18,000 naira ka ndị omeiwu na-eri udị ego ahụ. Ọ sịrị na ihe ọ jiri kwụọ otu a bụ na ọ ka na-ara ụfọdụ gọvanọ ahụ ịkwụ ya bụ ụgwọ ọpekatampe kemgbe e bidoro ya. Shehu Sani si na ihe mere ha ejibeghị mee ihe gbasara nnukwu ego ahụ ha na-eri bụ maka na ""a na-ezo ya ezo."" Ọ sị na ya ""kenere chukwu na ọ pụtala ihe ụgbụa agbanyeghị na ọ bụ ihe ihere"". Maazi Esan siri na ndị omeiwu ji ndị Naịjirịa na-ọrụ mere ha jị eri udị ego a ebe igwe mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ kwụkwara na ụgwọọnwa ndị ọrụ erụghị $50 ma agbanwoo ya ma ya fọdụzie ịzuru ha n'ọwa. Ọ sịrị na ụfọdụ ndị ọrụ enweghị ike ịnye ezinaụlọ ha nrị ọnụ n'ọwa ebe ụfọdụ n'ime ha bụ ọgbenye ọnụntụ. O kwuru na ọbụrụ na ndị omeiwu ga na-eri ụdị ụgwọ ahụ ha mara na a ga-etinyere ndị ọrụ ihe n'ụgwọ ọnwa. Anyị ga eke nkwucha mara ihe anyị ga eme maka ya - Esan Odeakwụkwọ ndị NLC siri na ha ga-akpakọ isi ọnụ mara ka a ga-esị kwọọ ya bụ onye ukwu wara. Ọ sịrị na ọ dị mmkpa ịkwụsị ndị NASS ugbua maka ihe a maghị kwụrụ na Naịjirịa. Peter kpọkụrụ ndị ọrụ ụdị okwu a dị na aka ka ha tinye anya na mmiri were chọwa ihe dabara mmiri iji mara ihe ha ga-eme ka-enwere webilata ego ole ndị ọrụ gọọmenti na-eri. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46633012,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46633012,Enweghi ego emela ọtụtụ ndị mmadụ ịtọ n'ụlọọgwụ,O nweghi onye na-ekpe ekpere ka ọrịa bịakute ya mana ọ bụ otu ihe nwereike ịdakwasị onye ọbụla.,"Mana ọtụtụ ndị ogbenye ebela akwa arịrị gbasara etu ndị ụlọọgwụ siri kpaso ha agwa maka na ha ejighi ego ha ga-eji kwụọ ụgwọ ụlọọgwụ. Ndị ụlọọgwụ Iyienu dị n'Ọnịcha ekweghi ka Ngozi na di ya Chinonoso Osegbo hụ ozu nwa ha nwụrụ anwụ maka na ha akwụghi ụgwọ. N'akụkụ nke ya, Chiamaka Ogbodo nọrọ n'ụlọọgwụ ihe karịrị otu afọ ka ọ mụchara nwa maka na o nweghi ike iweta ego ụlọọgwụ nyere ya kwụọ. Ndị a bụ ndị a kpọrọ aha n'ihe gbasara okwu a mana ọtụtụ ndị mmadụ na-agabiga ihe a na Naịjirịa niile." afirika-50343736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50343736,Omoyele Sowore: A ga m akpụpụ DSS ụlọikpe ma ha emeghi ihe ha kwesiri - Femi Falana,"Ọkaiwu na-anọchite anya Omoyele Sowore sị na ""Department of State Service"" (DSS) emebeghi ihe ụlọikpe sị ha mee na-agbanyeghi na-e nyere ha akwụkwọ.","Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Femi Falana sị na DSS enwetela akwụkwọ ụlọikpe ji si ka ahapụ Sowore mana ha ekwebeghị ịtọhapụ ya. Ọ sị na ya ga-agba ha akwụwkọ ma ha emezughi ihe ụlọikpe kwuru. Cheta na Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nọ n'ọnwa Ọktoba nye Sowore ohere ịla ma ọ kwụọ otu narị nde naịra ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ejikwa ego ole ahụ gbaara ya akaebe. Kemgbe ahụ, nwaamadị ahụ tọrọ na mkpọrọ maka na o nweghị onye ga-agbara ya akaebe. Nke a bịara ka Maazị Falana gara Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja gaa gwa Ọkaikpe Ojukwu na o mezuola ihe a sị ya mee iji tuzuo ịtọghapụ. Olileanya na a ga-atọghapụ Sowore ụnyaahụ bụ ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, amịtaghị mkpụrụ. Femi Falana Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri dee, ndị DSS ekweghị ahapụ ya. Ka ha sị dee, ihe DSS kwuru mere ha ji ka jide ya bụ makana ha emechiela ọrụ mgbe ozi si ụlọikpe rute ha aka. BBC Igbo kpọrọ Maazị Falana ịmata nke bụ eziokwu, o were sị na a sị ka ha laghachite n'elekere iri nke ụtụtụ a bụ abalị asaa nke ọnwa Nọvemba. ""Ndị ọrụ nọ n'ụlọ ọrụ DSS ụgbụa, kpọghachite m ma ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ a."" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Nwa ebu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi'" afirika-43288396,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43288396,Onyeisiala Buharị ga-aga Taraba Steeti na ndị ọzọ,Onye nkwuchite ọnụ onyeisiala Naịjirịa bụ Femi Adesina ekwuola na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga Taraba Steeti taa.,"Buhari ga-aga ihe ruru steeti ise ndị nwere ọgbaghara Nke a bụ maka ọgbaghara ndị na-eyi ndụ egwu butere nakwa mkpamkpa ndị omekome na-akpa na steeti ahụ gunyekwara ọgbaghara dị n'etiti obodo dị icheiche nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ruru otu narị na iri a tọrọ. Onyeisiala Buhari gwara ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha dekọọ akwụkwọ gbasara mberede ndị a merenụ. Dịka ọ natara akwụkwọ a ma gụkwa ya nkeọma, Onyeisiala Buhari ekpebiela ị ga jiri aka ya hụ etu ihe si mee nakwa ikasi obodo na ndị o metụtara obi. Bido taa bụ ụbọchị 5 nke ọnwa Maachị, Onyeisiala Buhari ga-aga Taraba ebe ọ ga-esi gaa Benue, Yobe, Zamfara na Rivers steeti. Onyeisiala Buhari na-anabata nkọwa gbasara steeti ndị a kwa ụbọchị ebe ya na ndị gọvanọ na-achị steeti ndị ahụ na-akpakọrịta gbasara etu ihe si aga na steeti ha. Onyeisiala Buhari na-akpọku ụmụ Naịjirịa niile ọkachasị ndị ọgbaghara ndị a metụtara ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka iji chụọ mpụ na ọgbaghara ọsọ ụkwụ eruala ma nwuchikwa ndị omekome ndị na-ebute ọgbaghara ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49148652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49148652,Ministerial screening: Ka o sị a ga n'ụlọomeiwu ukwu taa,Ụlọomeiwu ukwu amalitela ime nnyocha nke agba abụọ maka ndị onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ga-abụ Mịnịsta n'ọchịchị ya.,"Content is not available End of Facebook post, 1 Na mbido okwu ya, ọ o kelere Rochas Okorocha ekele pụrụiche maka ọrụ ya n'otu APC. Ndị ọzọ ọ kelekwara gụnyere Adebisi Akande, Segun Osoba nakwa Ahmed Tinubu. O kwuru na n'agbanyeghị ụkọ ego dị na steeti Osun mgbe ọ nọ n'ọkwa, na ọ gbara mbọ hụ na ndị ọrụ gọọmentị ka na-eri ụgwọ ọnwa. Babatunde Raji Fashola Fashola jị ngalaba atọ achịkọtara ọnụ na gọọmentị Buhari Mịnịsta hụburu maka ọkụ na ụlọ na Naịjirịa bụ Babatunde Raji Fashola bụ onye mbụ enyochara n'ụbọchị Mọnde. Sinetọ Rochas Okorocha so na sinetọ karịrị iri abụọ na asatọ gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ihe o mere na mbụ na ihe ọ na-akwado ime ugbua ahọpụtarala ya ọzọ. Mgbe Okorocha jụrụ maka etu Fashola ga-esi chịkọta ego ọ ga-eji mepụta ihe na mịnịstrị atọ achịkọtara nye ya, Fashola kwuru na ọ ga-adị mma ka ụmụ Naịjirịa na-atụkọta kịrị kịrị ego akpọrọ ""infrastructure fund"" nke ga-enye aka. Sinetọ Uche Ekwunife jụrụ ihe mere okporoụzọ sị Enugu gawa Onitsha ji bụrụ ihe a na-arụ ebighe ebi, Fashola gwara ya na ego kọ ndị ọrụ n'aka ha kwụsị ọrụ mana ya ga-ahụ na-enwetere ogbugbu maka ya bụ okporoụzọ. Ka ọ zakatara ajụjụ nnyocha a na-eme ya, Sinetọ Oluremi buru bata na-ayọ ka Fashola nye ndị mpaghara dị iche iche ohere irụ ọrụ na ministri ya. Nke a mere ndị mmadụ ji sewe ihu n'elu soshal midia. Muhammad Mahmood si Kaduna steeti Ihe gbagojuru ụwa anya bụ ka ndị sinetọ si mee kwam kwam wee si mịnịsta si Kaduna ya pụwa ghara ijụ ya ajụjụ ọfụma. Gbemisola Saraki si Kwara steeti Mgbe o ruru oge Gbemisola Saraki, ndị sinetọ kworo makana ọ bụbụ onye otu ha nye ya naanị ndụmọdụ ka o mee ka mmekọrịta dị n'etiti gọọmenti etiti na ụlọomeiwu ukwu na-aga siriri werere. Onyeisi Sineti bụ Lawan Ahmed kwuru na ya na ndị otu ya ga-aga obere ezumike ma chịghata azụ n'elekere abụọ iji metọpụ ya bụ nnyocha. Akukọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48766054,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48766054,Open Defecation Report: Naịjirịa bụ mba nke abụọ kachasị anyụ nsi na mbara ezi,Gịnị na-atọdị ndị mmadụ ụtọ n'ịnyụ nsị na mbara ezi?,"A na-akọwa na ọ bụ miri ozuzo mere ụlọ nsị jiri zee Ajụjụ a na-abịa dịka UNICEF kpọpụtara aha Naịjirịa dịka mba nke abụọ kachasị anyụ nsi n'ụwa niile n'ọgbakọ e mere n'Ibadan. Onye na-ahụ maka ihe gbasara ịdịọcha na ngalaba UNICEF bụ Bioye Ogunjobi kwuru na Naịjirịa bụ mba nke mbụ na-anyụkarị nsi na mbara ezi n'Africa. O kwuru na n'ime ọnụ ọgụ mmadụ nde iri anọ na asaa edepụatara n'akwụkwọ ""Water, Sanitation and Hygiene"" na ""National Outcome Routine Mapping""(WASH NORM), mmadụ nde iri na asaa (16milllion) si n'ugwu Hausa. Ihe ndị ọzọ edepụtara n'akwụkwọ a: Onye nnọchitere anya gọọmenti n'ọgbakọ ahụ kwuru na gọọmenti etiti na-agba mbọ ị hụ na a ga-akwụsị ịnyụ nsi na Naịjirịa na mbala ezi tupu afọ 2025 eruo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49931406,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49931406,Ihe 8 ndị ọzọ mere mbe a nọrọ afọ 344 ji bụrụ ọpụrụiche,"Na mbe a na-akpọ ""Alaga"" - bụ ihe pụtara agadị n'asụsụ Yoroba - nọ ndụ ruo afọ 344 tupu ọ nwụọ bu ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na-ada ebube.","Mana, mbe a bi n'obieze na-achị Ogbomosho nwere ihe ndị ọzọ so ya na-atụ ndị mmadụ n'anya. Echere na mbe ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-efe efe ga-atọ mbe niile bi n'ụwa tupu ọ nwụọ. Tupu o nwụọ, kwa ụbọchị, narị kwuru narị mmadụ na-aga n'obieze Soun na-achị ọgbọmọshọ akwanyere ya ugwu. Akụkọ oge gboo kwuru na ọ bụ Soun nke chịrị site n'afọ 1770 rue 1797 butere ya n'obieze ahụ mgbe ọ hụrụ ya n'ọhịa ka o si agha alaghachite. Lee ihe ndị ịmaghị maka mbe a pụrụiche: 1.A na-akpọ ya Alagba n'asụsụ Yoroba, nke a pụtara Okenye. 2.Nna nna onye bụ eze ugbua chọtara n'ime ọhịa mgbe o si n'agha alaghachite. 3.Ọ na-eri nri niile mmadụ na-eri dịka Amala, osikapa, agwa, plantain, na ogede. 4.Ndị ọkachamara ndị ọzọ nwere nkwenye na mbe Ogbomosho bikarịrị agbụrụ mbe ndị ọzọ na ndụ. 5.O nweghi dọkịta Bekee bịara mbe ahụ nso maọbụ gbaa ya ọgwụ na ndụ ya niile. 6.A na-enye ya nri sọsọ ugboro abụọ n'ime ọnwa, ọ naghịkwa apụ apụ nanị ma ọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ. 7. Ndị mmadụ na-aga ekpere ya maọbụ nata ya onyinye maka ihe ọbụla ha chọrọ. 8) Mbe ogbomosho a nwere ndị na-eleta ya iche n'obieze Soun dị n'Ogbomosho Ihe onyonyo ga-amasị gị Lee ụmụanụmanụ dị icheiche bi n'ogige ha n'Imo steeti Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-43870981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43870981,Ndị igwe mmadụ agbaala nwa Naịjirịa ọkụ na Sawụtụ Afịrịka,A gbaala nwa Naịjirịa ọzọ ọkụ n'obodo Rustenburg dị na mba Sawụtụ Afịrịka dịka igwe mmadụ ahụ a gbasịrị ụgbọala ya ọkụ.,"Ndị Sawụtụ Afịrịka na-ebuso ndị si mba Afịrịka ndị ọzọ agha Onyeisi otu ụmụ Naịjirịa bi na Sawụtụ Afịrịka bụ Adetola Olubanjo kwuru nke a. Ihe a mere ọhụrụ a na-egosị na agha ndị mmadụ na Sawụtụ Afịrịka na-ebuso ndị Naịjirịa bi n'obodo ha. Ndị uweojii na Sawụtụ Afịrịka ekwukwala na ihe ahụ mere bụ eziokwu ebe ha kwuru na e nwere ebe abụọ ndị a na-amaghị gbara ụgbọala ọkụ. Ha kwuru na n'otu nime ụgbọala ahụ a gbara ọkụ, otu nwoke gbalahụrụ ha mana o merụrụ ahụ nke ukwuu dịka a kpọrọ ya ọkụ mana o mesiri nwụọ n'ụlọọgwụ. Ogbugbu a na-abịa n'ihe na-erughi mkpụrụ ụbọchị iri e gburu ThankGod Okoro n'obodo Florida West Rand dị na Johanisbọg. Ndekọ na-egosi na e gbuola ụmụ Naijirịa ruru mmadụ 117 na mba Sawụtụ Afịrịka kamgbe ọnwa Febuwarị afọ 2016. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-56817749,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-56817749,UK Asylum to Ipob: Mba Briten ewepụla atụmatụ ịnabata ndị na-achọ nwereonwe Biafra na ọba ịntanetị ha,"Ngalaba gọọmentị Briten a kpọrọ ""Home Office"" ewepụla ozi dịbụ ba ọba intanetị ha na-akọwa etụ a ga-esi nye ndị na-agba ọsọ ndụ maka ha so n'otu na-achọ nwereonwe Biafra.","Cheta na akụkọ pụtara na mba Briten etinyela uchu na okwu inye ndị na-achọ Biafra ihe Bekee na-akpọ ""asylum"" site na ịwepụta usoro a ga-esi na-ahazị akwụkwọ ndị di etu ahụ wetere. Mana ugbua, akwụkọ ahụ adịghịzị na webụsaịtị ""Home Office"". Ọ bụ onye ntaakụkọ Kadaria Ahmed bu ụzọ gbaa ama na akwụkwọ usoro a adịghịzị ma kwuo na ozi mba UK zitere ha sị na a na-ahazigharị ya bụ akwụkwọ. Ọ sịkwa na ha si na ha ga-etinyegharị ya ma ha mechaa nhazi a. BBC Igbo zigara ""Home Office"" ozi ịmata etu ihe siri kwụrụ ugbua mana ha asabaghị. Atụmatụ ""nhazigharị"" inye ndị na-achọ Biafra ohere ịgbata ọsọ ndụ na Briten bịara ka Naịjirịa gbarụchara ihu maka ya Inye ndị Ipob 'Asylum' bụ mkparị nye anyị- Gọọmenti Naịjirịa Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram? Gọọmenti Naijiria egosila iwe ha na ohere mgbapụ ka ala Bekee nke mba Briten nyere ndị otu nwereonwe Biafra bụ Ipob. N'oge ọ na-asa ndị ntakụkọ okwu na nsonso a, Minista Mgbasaozi bụ Lai Mohammedd kwuru na atụmatụ ọhụrụ ahụ Briten hiwere maka ịnabata ndị Ipob gọọmenti na-akpagbu bụ ""mkparị"". Usoro ọhụrụ mba UK ga-eji nabata ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) nakwa Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (Massob) na-agba ọsọ ndụ bụ ihe ụwa kpụ n'ọnụ ugbua. N'ime akwụkwọ usoro ahụ dị na ọbaozi gọọmentị mba Briten ha bụ ụzọ depụta ihe nwereike ime ka ekwuwe okwu nnabata ndị a na-agba ọsọ ndụ nke gunyere mmegbu makana onye ahụ so n'otu Biafra. Lee usoro ndị ọzọ: 1. Nyocha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ: Mba UK kwuru na ha ga-ebuzo nyocha ma o nwere ihe ziri ezi gbasara onye ahụ so n'otu Ipob maọbụ Massob agba ọsọ ndụ. Ha ga-ele ma itinyebuola akwụkwọ igba ọsọ ndụ maọbụ akwụkwọ ipụ apụ na mbụ ọbụla. Ha ga-ele ma o nwere visa ọbụla aha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ dị na ya tupu agba ya ajụjụ ọnụ maka nnabata maka ọsọ ndụ. A ga-enyocha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ maka nwalee isụ asụsụ. 2. A ga-elebanya n'okwu ndị na-agba ọsọ ndụ n'otu n'otu Ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-elebanya mara ma e nwere ihe siri ike dị iche a ga-eji maka ya nabata ndị a na-agba ọsọ ndụ. A ga-elebanya anya n'okwu gbasara ndị a na-agba ọsọ ndụ n'otu n'otu na-abụghị dịka igwe mmadụ. O bụrụ na onye ahụ esoghị n'atụmaatụ 'Refugee Convention' agaghị enye ya nchekwa ikike dịara onye. 3. Ihe siri ike mere onye ahụ ji agba ọsọ ndụ Nke a gụnyere na ndị na-egosi nkwado atụmaatụ ndọrọndọrọọchịchị ọbụla erughị ogo ka anabata ha dịka ndị na-agba ọsọ ndụ. Ajụjụ a na-ajụkarị bụ imata ma onye ahụ e nwere ihe ngosi zuruoke na-egosi na ụjọ ji ha maka mmegbu a na-emegbu ha gbasara echiche ndọrọndọrọọchịchị ha. 4. Ihe ize ndụ Nke a pụtara ihe ize ndụ ndị otu ahụ na-agabiga maka ihe ha na-achọ maọbụ nke ha buterela mba ha. Akwụkwọ ozi ahụ mara atụ sị na onye ọbụla na-akwado Ipob nwere ihe ize ndụ gụnyere nwụchị, ịga ụlọmkpọrọ nakwa mmegbu. E depụtara na ha ga-enyocha okwu onye na nke ya iji mata ma o were ihe gosiri na ha na-agabiga ihe ize ndụ mmkpagbu. N'akwụkwọ ozi ahụ ndị ọnụ na-eru n'okwu kwesiri ịnyocha mara ma ntuzi gọọmenti nyere otu Ipob na massob ndị a ọ bụ ima ha ikpe ka ọ bụ imegbu ha. N'okwu ha, ndị na-agba ọsọ maka ikpe mara ha maọbụ ntaramahụhụ maka arụrụala ha rụrụ abụghị ndị na-agba ọsọ ndụ. Mana ima ikpe nwereike ibute mkpagbu maọbụrụ na ndị nọ n'ọchịchị ji aka ike na-emeso ịma ikpe ahụ. 5.Nchekwa Ọ bụrụ na onye ahụ gosi na ezigbo ụjọ ji ya maka mmegbu mba ya, nke a pụtara na ha agaghị enweta ezi nchekwa n'aka gọọmenti mba ahụ, dịka akwụkwọ usoro ahụ si kwu. 6. Mgbapụ ọsọ ndụ n'ime mba onye ahụ na-agba ọsọ ndụ si Ọ bụrụ na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ gosiri na ezigbo ụjọ ji ya maka mmegbu si n'aka gọọmenti mba ya, ọ ga-arịa ahụ onye ahụ igbaga ebe ọbụla izere ọdachị ahụ. 7. Mkpebi Ọ bụrụ na ajụ ịnabata mkpesa ndị otu a na-agba ọsọ ndụ, o gosighị na mkpesa ahụ bụcha asị. Nke a bụ dịka akwụkwọ iwu ndị mbiarambiara na-agba ọsọ ndụ nke afọ 2002 nke nị mba UK . Ihe ndị otu Massob kwuru maka usoro ndị a Onyeisi otuMovement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (Massob) bụ Raph Uwazurike kwuru na ha anabataghị usoro ndị a. O kwuru na ndị mba UK e jighị obiọma wee na-eso ndị Igbo makana ọ bụ akụ na ụba ndị Igbo na-edenyụ anya. O kwuru na ndị UK kwesiri igwa ndị ọchịchị Naịjirịa ka ha gee otu ndị na-achọ Biafra nti ma mere ha ihe ha na-achọ bụ nwereonwe. Ipob ọ kwukwaranụ gịnị? Ọkaiwu ndị Indigenous People of Biafra bụ Alloy Ejimakor kwuru na onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu achọghị ka ndị na-achọ Biafra gbawa mba Britein kama ihe ha chọrọ bụ Biafra. O kwuru na ihe Britein gosiri site n'inabata ndị otu Ipob na-agba ọsọ ndụ bụ na ha abụghị otu na-eyi egwu dịka Naịjirịa si kpọ ha. O kwuru na gọọmenti Naịjirịa kwesiri iche echiche mara uzọ ọzọ dị mma ha ga-eji soro ndị otu Ipob ka e wee meta ha mma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49699860,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49699860,"Hotel Murders: ""Ọ bụ akwụnakwụna na-ebute ogbugbu ndịa"" Ndị uweojii",Ụmụnwaanyị Rivers Steeti emeela ngagharị iwe ga kwuru ndị uweojii dika enwetara ozu nwa agbọghọ ọzọ n'ime ụlọ ọriri n'Omoku.,"Nke bụ ozu ise a na ahụta na ụdị ọnọdụ a na ụlo oriri na Rivas Steeti n'ime otu ọnwa. N'ime ọnwa gara aga ka ndị uweojii kwuru na egburu ụmụnwanyị atọ n'ụlọ oriri dị na Pọtakọt ma kowaa kwa na atọgburu abụo n'ime ha. N'aka nke ọzọ ka osote onyeisi ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Chuks Enwonwu gwara umuwnayi a na ha ka na-eme nyocha. Enwonwu kwukwara na ọ bụ ọrụ akwụnakwụna na ebute mkpamkpa. Kama nwaada haziri ngagharị iwe a bụ Soibi Ibibo kwuru sị "" ọ bụrụ godi akwunakwuna, ndụ mmadụ di mkpa, ha bụkwa madụ"" Enwonwu kọwakwara na ha ejidela ụfodụ ndị maka ogbugbu umunwanyi ndia ma sị kwa na ha na ụlooriri ndi di na steeti ahu na enwenzụkọ maka nkea. Onyeisiala azọpụla njem Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gaa na nzụkọ pụrụiche nke ECOWAS hibere maka ịlụso otu ndị na-eyi ndụ egwu agha. O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu nakwa Minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama so ya aga njem ahụ. N'otu aka ahụ Osote onyeisiala Naịjirịa N'otu aka ahụ osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ga-anọchite anya onyeisiala Naịjirịa n'akwamozu Robert Mugabe nke mba Zimbabwe kwadoro ya n'ụbọchị satode. Cheta na ezinaụlọ Mugabe nakwa gọọmentị ala ahụ nweburu nkenke esemokwu maka ebe a ga-eli ya. N'akụko ọzo , Yemi Osinbajo ekwuola na Gọomenti etiti ga-akpọpụta ndị Naijirịa di otu nari nde site n'aka ubiam pụta. Osinbajo kwuru nkea mgbe ọ gara ihu Eze Gwandu na Kebbi steeti, ma kwee nkwa na gọọmentị ga-emenwu nkea n'ime afọ iri ma ndị gọomentị steeti tinye aka. N'ofesi Ụlọakwụkwo niile na mpaghara ebe ide mmiri a mere emechiel Ide mmriri ataala isi mmadụ atọ n'mba spain dịka oke mmiri ozizo mere ka ikpere mmiri sofee oke ya were nụbata ebe ndị mmadu bi n'obodo Valencia, Murcia na owụwa anyanwu Andalucia. Gọọmenti spain ezipụla ndị nchekwa n'obodo Valencia, Murcia na owụwa anyanwu Andalucia ebe ide mmiri a kacha akpa ike. Felicity Huffman na-eme ihe onyonyo Desperate Housewives ga-aga ụlọ mkpọrọ ihe ruru abalị iri n'anọ maka nrụrụaka. Cheta na achọpụtara na Huffman kwụrụ ụgwọ ịgbanwe ule nwa ya nwaanyị ga-enyere ya aka ịbanye Mahadum di ukwu na mba Amerịka. Goaaaaaaaaaaaaal! Ụbọchị taa abụghị ụbochị ọma nye ndị Wolves dịka ndị Chelsea jiri goolu saa ha ahụ. Ụmụ Naijiria abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori gbachara aka ahịa ka goolu nọ na-arị ibe ya elu n'egwuregwu a. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo ga-amasị gị Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara" afirika-48735845,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735845,MMM re-launch: Onye ọ bụla jiri ire ya gụọ eze ya ọnụ - EFCC,Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision(EFCC) dị n'Enugu bụ Chris Oluka ekwuola na MMM bụ ajọ ihe ma na-arịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gbara atụmaatụ a ọsọ.,"MMM Re-launch: Ndụmọdụ EFCC nyere ndị chọrọ ịbanye atụmaatụ a ọzọ Oluka kwuru ka ụmụ Naịjirịa jiri ire ha gụọ eze ọnụ gbasara ya bụ atụmaatụ. Gere ihe okwuru n'uju n'ihe ọkpụkpọ. ""Ihe MMM mere m"" Onye na-achọghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC na o tufuru ego ruru nde naira ise na ụma, kwuru na MMM agaghị eme ọfụma dịka ndị nwe ya malitere ya ọzọ. O kwuru na ọ ga-echefu ego niile o tufuru tupu MMM emechie na mbụ gbara ya bụ atụmaatụ ọsọ. O kwuru na dịka onye gbagotere n'ọkwa mgbe mbụ MMM pụtara, na ọ ga-adụ ụmụ Naịjirịa ọdụ ha abanyekwala atụmaatụ a ọzọ. ""M ka ga-eme MMM ọzo"" Mana onye ọzọ ji ego o ritere na MMM ruru nde atọ wee zụta ala kwuru na ya ga-abanye ọzọ. O kwuru na ọ bụ akọ na uche ka eji abanye MMM makana a ga-enwerịrị ndị ọ ga-akwa na ndị ga-erite uru na ya bụ atụmaatụ. Kamgbe ụlọọrụ MMM depụtachara n'akara webụsaiti ha na ha malitela ọzọ, lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal media.‏ @EmyOputa kwuru na ọ bụrugodi na ha apụtara ọzọ n'ezie, na ya agaghị etinye aka ebe ahụ ọzọ. @Ojjobalo kwuru na ọchị na-atọ ya makana ndị mmadụ amụrụla akọ Mana ‏@am_daboss kwuru MMM abiala ịnọdụ. @aliyyzacs kwuru ka gọọmenti etiti nyocha ha ọfụma. @Da1aniekan kwuru na ọ gaghị abanye ọzọ ma ncha ma ncha. @VICKNNADI1 na-arịọ ụmụ Naịjirịa ha ekwela ka a rafuo ha ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43307724,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43307724,Jamb na EFCC: Onyeisi m narala m naịra 36nde ahụ,Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ịchụ mpụ ọsọ bụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) n'aha ịchafụ ekwuola na ha na-agba ndị ọrụ Jamb bụ Philomina Chieshe ajụjụọnụ.,"Ndị EFCC na-eme nyocha banyere mpụ dị na Jamb Chieshie bụ onye kwuburu na agwọ loro ego ruru naịra 36 nde nke ndị Jamb retere na kaadị ule. EFCC kwuru na ha gbara Chieshie na onyeisi ya na ụlọọrụ Jamb dị na Makurdi Benue steeti Samuel Sale Umoru ajụjụọnụ. Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb ndị ọzọ a na-ele anya na aka ha dị na ya Mana ugbua, Chieshie ekwugharịala ihe o kwuburu na mbụ, o kwuola ugbua na ọ bụ oga ya Umoru nara ya ego ahụ na ọ bụghị agwọ loro ya. Nchọpụta ndị a nọ n'akwụkwọ ndị EFCC wepụtara dịka ndị mmadụ na-akatọ EFCC na onweghi ihe ha mere gbasara ebubo nwaanyị ahụ boro agwọ. Lekwa agwọ loro nde naira 36 Ndị EFCC na-agba ya ajụjụọnụ kemgbe ha bidoro nyocha gbasara akataka mpụ na ohi na-aga n'ụlọọrụ EFCC. Chieshe gwara ndị EFCC na ọga ya bụ Samuel Sale Umoru nara ya ego ndị ahụ na mpekere mpekere. O kwuru na Samuel na-agwa ya wepụta ego ndị ha retere na kaadị ule n'ụlọakụ ya. n'okwu ya - ""Ego m na-ewpụta, ọga m na-eji ya etinye n'ụlọọrụ, ụfọdụ oge o jiri ya maka onwe ya"". O kwukwara na ya adọọla oga aka na nti ọtụtụ oge maka ego ahụ ọ na-ewere mana ọ naghị anụ. Ụfọdụ ego ahụ o wepụtara gunyere puku naịra 340 o wepụtara ụbọchị 5 na 24 ọnwa Mee afọ 2014 nakwa puku naịa 120 o wepụtara ụbọchị 17 na 18 ọnwa Juunu afọ 2014 wdgz. Ndị EFCC ekwuola na ndị nyocha ha achọpụtala na akwụkwọ ego si n'ụlọakụ Chieshie gosipụtara ihe ndị o kwuru, nke kpatara ha jiri kpọbata ọga ya ịgba ya ajụjụọnụ. Gịnị ka Umoru kwuru Ụmoru agọnaghị ebubo a e boro ya mana ọ nara mgbapụta n'aka ndị uweojii ma na-agakwa n'ụlọọrụ ndị EFCC igosi onwe ya kwa ọnwa. Mana ihe na-atụ n'anya bụ na ihe ndị a niile Chieshie kwuru apụtabula tupu akụkọ agwọ apụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 47987055,https://www.bbc.com/igbo/47987055,Good Friday: Ihe Easter ji apụrụ m iche karịa emume ụka ndị ọzọ',Emume Easter nke gụnyere Holy Thursday na Good Friday bụ emume pụrụ iche n'etiti ndị otụ Kraisti dịka ọ bụ mmemme eji echeta ọnwụ Jisọs Kraistị na mbilite n'ọnwụ ya.,"Ụmụakwụkwọ Loyola Jesuit College, Gidan Mangoro, Abuja dịka ha na-eme afụfụ Jịsọs Kraisti ụbọchị 'Good Friday' Mana etu ihu ndị mmadụ sị dị iche, ka etu ihe Easter pụtara ha dị. 'Easter pụrụ m iche n'ihi na Ada m mụụ ejima' Amaka Umeh, onye bụ onyenkuzi kwuru na ezịnaụlọ ndị di ya na-akpọ emume 'Easter mkpa karịa Ekeresimesi. ""Ọ bụ mgbe ndị ezịnaụlọ ndị be di m na-eme mgbakọta dịka ezinaụlọ; ha na-esi ebe niile ha bi lọta, mee ekpere, merụba ụbọchị."" ""Ọ na-adịrị anyị ka Ekeresịmesi."" Umeh ka ndị ka nwa agbọ aga ekenye dị ọhụụ na enwe ọnụ na ada ya nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'izu a. O kwuru na, ""Easter afọ pụrụ ya iche n'ihi na ""abụrụla mmama nnukwu. Nwa m nwaanyị ritere ejima ụbọchị 'Holy Wednesday"". 'Emume ụka abalị Easter na-awụm akpataoyi' Egwu mbilite n'ọnwụ Kraist na-awụ Amaechi Theo-Vincent akpataoyi ""Amaechi Theo-Vincent ejighị emume Easter achị. Na nkọwa ya,ọ bụ oge mbilite ọnwụ Jisọs Kraist n'ihi na ""ọ bụrụ na o biliteghị n'ọnwụ nkwenye m na Kraistị kara abụ ihe efu."" Ihe Easter jikara pụrụ Theo Vincent iche bụ otu egwu ndị ụka Katọlik na-agụ n'abalị Easter. "" O biliwo ee h O biliwo Jesọ akpọgidere n'obe oh ,Onye mmeri."" ""A na-agụ egwu ahụ, na-akụ ịgba, akpataoyi a na-awụ m. ọ dị m ka a hụụ m Jeso ka ọ na-ebilite. Ya mere na ọ na-amasị ịga ụka abalị Easter."" "" Ọ bụrụ n'obodo, a na-agba egbe mkpọnala ma elekere iri na abụọ nke ime abalị.""Ọ na-awụ m akpataoyi, ụfọdụ anyammiri ọnụ na-apụta n'anya n'ihi ihe Jisọs mere m."" 'Emume ụka Easter na-atọ m iche' Blessing Nwobodo-Itua kwuru n'ihe na-atọkarị ya n'Easter bụ emume 'Easter'. ""Oge Easter kachasị tọọ m bụ oge m nọ na mahadụm 'Madona University' n'ihi etu emume Easter si aga ebe ahụ dịka ogbe jikọrọ ọnụ. ""Ma ndị sista, ma ndị fada na ụmụakwụkwọ na-agbakọta ọnụ maka emume ahụ bido n'ụbọchị Good Friday, Holy Saturday nakwa ụka Easter n'onwe ya."" ""Mana ugbua n'ihi ọrụ na mkpa dị ọzọ ọ na-ewute m na anaghị esonye n'emume Easter n'ihi na Easter dị mkpa Karia Ekeresimesi."" "" Ọ bụrụ na e nweghị Easter, angaghị enwe okpukpere ụka Kraistị."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46856509,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46856509,"Justice Onnoghen: Nnia Nwodo, ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ na ọlụọla Niger Delta etinyela ọnụ",Anụbeghị okwu ikpeazụ gbasara ikpọpụ ọkaipe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe akpọrọ Code of Conduct Tribunal (CCT) taa bụ Jenụwarị iri na anọ.,"Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo kwuru na udiri mkpebi a nwereike itinye Naịjirịa na nnukwu ọgbaghara ga-ebute ọtụtụ ikwafụ ọbara. Otu ọlụọla si na ""Niger Delta"" dọrọ onyeisiala aka na nti na ọ bụrụ na ọ kwụsịighị atụmmatụ a, na ha ga-awakpo ebe niile a na-arụpụta mmanụ agbidi na Naịjiria. Onye ozi Niger Delta Watch dogs, coalition of Niger Delta agitators bụ John Duku depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara ụnyahụ. Ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ gụnyere gọvanọ isii gwara Onnoghen n'ọgbakọ mere ụnyahụ bụ Jenụwarị iri na atọ na ya gbachị oku ọbụla Code of Bureau kpọrọ ya. N'okwu ha, "" ọ bụ eziokwu na anyị anaghị agba ibuso nrụrụaka agha mgba mana udiri a ekwesighị ekwesi makana iwu obodo akwadoghị ya."" Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen ga-apụta n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde ịzara ọnụ n'ebubo ekwupụtaghị akụnaụba ya. Okwu banyere ịkpọpụ ọkaikpe Walter Onnoghen abụrụla ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji atụnyere nke Kemi Adeosun n'ụzọ dị iche iche. Ụfọdụ ndị kwuru na ebe Kemi Adeosun gbara arụkwaghịm n'ọrụ n'ihi asambodo adịgboroja na Onnoghon kwesiri n'otu aka ahụ ịgba arụkwaghịm. Souljah kwuru na ndị ire abụọ katọrọ Kemi Adeosun kpụzi akwụkwọ iwu n'ọnụ ugbua: Ha kwuru na ihe ọjọọ bụ ihe ọjọọ agbanyeghi onye mere ya, na onweghi onye karịrị iwu na-achị Naịjirịa. David Atta kwuru na Kemi Adeosun mere ihe ọjọọ ndị mmadụ akpụrụ ya n'ọnụ na ugbua bụ oge nke Onnoghen ị zara ọnụ ya: Ebe ndị ọzọ kwuru na a kpọpụghi Kemi Adeosun n'ụlọikpe, na e kwesighi ịkpọpụ ọkaikpe Onnoghen n'ụlọikpe. Bubeangel kwuru na oge nke Adeosun na Buhari nyere aka kpọpụya na mba ofesi mana ọ chọrọ ịkpọpụ Onnoghen n'ụlọikpe: Sịnetọ Shehu Sani nke Kaduna Steeti kwuru na ikpọpụ Onnoghen n'ụlọikpe bụ imetọ ikike na-eche ikpe ziri ezi na Naịjirịa. N'aka nke ọzọ onye bụbu onyeisi otu jịkọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa (NBA) bụ Olisa Agbakoba kwuru na etu esi kpọpụ ọkaikpe Onnoghen n'ụlọikpe adịghị mma. O kwuru na ọ bụ otu jikọtara ndị ọkaikpe kwesiri ibu ụzọ nyocha Onnoghen ma ọ bụrụ ọkaiwu gọọmenti bịa kpesara ha. Agbakoba gwara BBC na ọkaikpe Onnoghen nwere ikike na-echekwa ya na ikpe a agaghị adị mfe n'okpukpe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47102159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47102159,Atiku Endorsement: Anyị enyela Nnia Nwodo 'suspension' - Uche Okwukwu,Okwu abaala na akụkọ asi na-asị n'etiti otu jikọta Igbo niile bụ Ohaneze Ndigbo.,"Nnia Nwodo chọrọ nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara nke a kpọrọ 'Restructuring na bekee Nsogbu a sitere na nkwado Ohaneze nyere onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) bụ Atiku Abubakar. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, aka na-achị Ohaneze bụ Nnia Nwodo kọwara etu nkwado Maazi Abubakar siri pụta ma kwuo ihe oji di mkpa. Lee ihe okwuru: Mana, n'ụbọchị Tụsde, BBC nụrụ na achụọla ode akwụkwọ Ohaneze bụ Uche Okwukwu n'ọrụ. Ozi a sị n'ọnụ Uche Ogbaga bụ onye ode akwụkwọ mgbasa ozi Ohaneze. Okwukwu n'onweya jụrụ atụmatu ọchụchụ ya a, na-ekwu na ọ bu Nwodo ka achụru makana ọ dara iwu Ohaneze mgbe onyere Abubakar nkwado ahụ. Lee ihe okwuru ebe a: Okwu Uche Okwukwu" afirika-49804085,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49804085,"P&ID Nigeria: Malami, Lai Mohammed, Emefiele agaala ikpe udo na UK",Ndị nnọchite anya gọọmentị etiti awụchiela na mba UK maka okwu gbasara akwụkwọ ụlọọrụ P&ID gbara Naịjirịa na-asị ka a kwụọ ha ijeri naịra itoolu na ụma.,"Ikpe Naịjirịa na P&ID Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu so wee mee njem a. Ndị ọzọ gụnyere onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, osote onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Lmorde, na onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka (EFCC) bụ Ibrahim Magu. Ha gara ịmata ka a ga-esi jiri nwayọ dozie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị P&ID. Ụlọọrụ Thomas Cook ekubiela Ụlọọrụ Thomas Cook nwere ụgbọelu dị iri itoolu na anọ Njinji ejiela n'obodo Eliza dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ime njem a kpọrọ Thomas Cook pịachiri ọrụ n'ụbọchị Mọnde. Ụlọọrụ Thomas Cook nke malitere kamgbe afọ 1841 so n'otu ụlọọrụ a ma ama maka ịhaziri ndị mmadụ njem ụgbọelu ha. Ọ dị ọtụtụ ihe mere ka ya bụ ụlọrọụ pịachie mana nke bụ isi sekpụ ntị bụ okwu ego. N'ọnwa Mee afọ a, ụlọọrụ Thomas Cook kwupụtara ọghọm ruru otu ijeri paụnd na ụma ise (£1.5 billion). Mbọ ikpeazụ ụlọọrụ ahụ gbara ka ha mara ma gọọmentị a ga-agbazinye ha ego dị narị nde paund abụọ na iri ise (£250 million) kụrụ afọ n'ala. Nke a mere ka ụlọọrụ ahụ kubie. Peter Fankhauser, onyeisi ụlọọrụ Thomas Cook Onyeisi ya bụ ụlọọrụ bụ Peter Fankhauser kwuru na mmechi ha wutere ya n'obi nke ukwuu. Mmechị ụlọọrụ ahụ ga emetụta ọrụ ndị mmadụ ruru puku iri abụọ na abụọ nke puku itoolu n'ime ha bụ ndị mba UK. Gọọmentị Abịa akwụbeghi ndị dọkịta ụgwọ Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Ndị dibia bekee na-arụ ọrụ na Abia State University Teaching Hospital eribeghi ụgwọ ọnwa kamgbe ọnwa iri na atọ gara aga. Nnamdi Irondu bụ ọnụ na-ekwuru otu jịkọrọ ndị dibia bekee ahụ gwara BBC Igbo na ha-agbaala abụbụ ọrụ ugboro ugboro mana nke ahụ emeghi ka ọnọdụ ha gbanwee. BBC Igbo kpọtụụrụ onye kọmishona na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia Steeti nakwa onyeisi ọrụ ntaakụkọ gọvano Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ mana ha azabeghị anyị ruo ugbua. Veberde a ga-ala? Ernesto Valverde, onye nkuzi ndị Barcelona Onye nkuzi ndị otu bọọlụ Barcelona bụ Ernesto Velverde chị obi n'aka ugbua n'ihi ọnyụpa ndị otu ya na-agba. Barcelona bụ ndị nke asatọ na tebulu La liga ugbua nke mere ka ndị mmadụ na-ekwu na a ga-achụ Velverde n'ọrụ. Gee nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe mere m ejighi nwee TV na be m - Cosmas Maduka" afirika-54269586,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54269586,Ụmụ Naijria nọ Switzerland na-eme ngagharịiwe na 'Nigerian Embassy' na mba ahụ,"Otu kpọrọ onwe ha 'Nigerian Youth Movement' na mba Switzerland edegarala otu dị icheiche akwụkwọ ozi gbasara ihe ha kpọrọ ""agwa ọjọọ"" ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba ahụ na-akpa.","Dịka ụlọ akụkọ Guardian siri kwuo, otu ahụ kwuputara nke a n'ozi ahụ ha degaara onye odeakwụkwọ gọọmentị Naịjiria, Ministrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ọzọ nakwa ụlọọrụ na-akwụsị mpụ bụ EFCC ha kpọrọ oku ha enyochaa ya bụ ụlọọrụ. Iwe ha bụ na onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba ahụ bụ Baba Magudu nakwa Kemi Amuda na-arụrụaka, ma kwuo na mmadụ abụọ ahụ na-eji ndị uweojii amaja ụmụ Naịjirịa bi ebe ahụ. N'ozi ahụ nke onye ndu ha bụ Ireydaer Omobude binyere aka ha sị,""Anyị na-akpọ oku ka a kpọghachi Baba Madugu na Kemi Amuda n'ala Naịjirịa n'ihi na ha anaghị achụ ọdịmma mba Naịjirịa nakwa ụmụ Naịjirịa na mba ahụ"" ka ozi ha kwuru. Otu ahu kwukwara na ha edebuola akwụkwọ ozi n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ a maka ofu okwu a mana ọ mịtaghị mkpụrụ Cheta na onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa n'ofesi bụ Abike Dabiri gọrọ ebubo mmegbu ụmụ Naijiria nọ na Switzerland na-ebo ụlọọrụ Naịjirịa na mba Switzerland na mbido izu a. Ihe onyonyo pụtaburu gosiri ebe ihe ndị e chere na ha bụ ndị uweojii mba Switzerland na-achụpụ ndị Naịjirịa bịara ịnata akwụkwọ njirimara onwe bụ ""Passport"" na Bekee n'ụlọọru nnochite Naịjirịa na mba Switzerland. Onye sere ihe onyonyo ahụ kwuru na ọ bụ kemgbe ụtụtụ ka ha kwụ ebe ahụ na-eche ka mmadụ za ha mana ndị na-arụ ebe ahụ kpọọrọ ha ndị uweojii mba Switzerland ị bịa chụpụ ha. Mana Abike Dabiri esila n'akara Twitter ya zipụta ozi na-ekwu na ọ bụghị ndị uweojii na-achụpụ ndị mmadụ na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa na-agbalị ibute udo. Dabiri kọwara na ọ bụ orịa Covid-19 mere ka e tinye iwu ịza naanị mmadụ iri kwa ụbọchị n'ụlọọrụ ahụ dị n'obodo Bern dị na Switzerland. ""Mmadụ 64 bụ ndị wujuru ebe ahụ ụbọchị ihe a mere mana naanị mmadụ iri n'ime kwadoro ka aza ha - ndị ọzọ akwadoghi tupu ha abịa"". ""Mana ha niile gbalịrị iji ike wụbanye n'ime ụlọọrụ ahụ mgbe Baba Madagu bụ onye na-anọchite anya Naịjirịa na mba ahụ chọrọ ịgwa ha okwu nke mere ka a kpọọ ndị ọrụ nchekwa inye aka kwụsị ọgbaghara ahụ""" afirika-49572221,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49572221,"South Africa Killings: Ụmụ Naijiria ewerela iwe mebie ihe n'ọdọ ahịa Shoprite, PEP","Dịka ngagharịiwe nke gara na-enweghị nsogbu ọbụla na Shoprite, Ikeja, Legọs, ghọrọ tigbuo-zogbuo mgbe ihe yiri ya mere na Shoprite dị n'Ọsapa/Jakande, Legọs ụbọchị Tuzde.","Nke a na-eme dịka akụkọ ogbugbu ụmụ Naijria na mmebi ngwaahịa ha na-arị elu, abalị ole na ole gara aga. Ndị ntorobia banyere n'ime Shoprite dị na Jakande were iwe na-akwatu ngwaahịa nọ n'ogogo ebe ahụ. Foto a si n'ihe nkiri ebe ndị ntorobịa ji okwute na mma obejiri wakporo ụlọahịa ahụ na-ekwu na ha na-achọ ụmụ Saụt Afrịka ka ha gbuo ha maka ụmụ Naijiria ha kwafurula ọbara ha. Otu onye Nollywood bụ Belinda Effah onye nọ n'ụgbọala nọ n'okporoụzọ dị nso na Shọprite dị na Jakande, bekuru gọọmentị ka ọ gbata ọsọ enyemaka tupu ihe emebie dịka ndị nọ n'ụzọ ije mgbe ọ na-akpọtụ hapụrụ ụgbọala ha gbaa ọsọ ndụ. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ya bụ ọgbaaghara ataala isi otu onye ebe a gbara otu ụgbọ ndị uweojii ọkụ. Ọgbaaghara ahụ mere ka e mechie ọdọahịa Shoprite ahụ n'ike. N'aka nke ọzọ, ndị mmadụ wakporo ọdọahịa PEP dị na Surulere dịkwa na Legọs. Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta okwu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Bala Elkana banyere nsogbu dapụtara na Legọs amịtaghị mkpụrụ dịka nwa amadi ahụ azaghị ekwentị ya. Kwụsịnụ iwakpo ọdọ ahịa ndị South Africa - Gọọmentị Naịjirịa Lai Mohammed na Nigeria information minister Ka ọ dị ugbua, Gọọmenti etiti adọọla ụmụ Naijiria aka na ntị sị ka kwụsị ibu agha megide ụlọọrụ ndị Saut Afrịka na Naijiria. N'ozi nke m̀ịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed wepụtara, O kwureur na ntụpụ ụkwụ a ga-emetụta Naijiria karịa Saut-Afrika. Na nkọwa, ya ụmụ Naijiria na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nọ na Naijiria karịrị ndị Saut Afrịka. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:" afirika-48167227,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48167227,President Umaru Musa Yar'adua: Ihe ndị Naịjirịa ji echeta ya,Afọ itoolu agafela kamgbe aka chiburu Naịjirịa bụ Umaru Musa Yar'adua nwụrụla.,"Yar'adua bụ onyeisiala nke iri na atọ chịgoro Naịjirịa. Ndị ama ama na Naịjirịa gụnyere osote ya bụ Goodluck Jonathan mgbe ọ chịrị mba ahụ depụtara ihe ha agaghị echezọ maka Yar'adua. @GEJonathan kwuru na nna ya ochie Yar'adua bụ nwoke fere ala Naịjirịa n'ụzọ kwụọtọ na-enweghị ntụpọ. End of Twitter post, 1 @atiku kwuru na Yar'adua bụ nwoke ji obi ebere na obi dị umeala wee chịa Naịjirịa. ‏@ShehuSani bụ mmadụ na-akwanyere iwu obodo ugwu ma bụrụkwa onye eziokwu. @iSlimfit kwuru na Yar'adua so na otu onyeisiala ntụzị ya kwụ ọtọ na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52326014,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52326014,Rivers State: A gbanweela onyeisi ndị uweojii,Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu agbanweela onyeisi uweojii na Rivas steeti aha ya bụ Dandaura Mustapha.,"Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa, Mohammed Adamu Onye ga-anọchi anya Mustapha bụ Joseph Gobum Mukan. Nke a bụ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mbah. Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike kwuchara okwu n'igwe TV ebe ọ nọrọ kpọọ oku ka gọọmentị etiti na-enye Rivas steeti oke ruuru ya. Amabeghi ma o nwere ihe jikọrọ okwu Nyesom Wike kwuru na TV na mgbanwe a gbanwere onyeisi uweojii steeti ahụ. Ihe ise Nyesom Wike kwuru mere soshal midia ji nwuru ọkụ Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas steeti Gọvanọ Rịvas Steeti, bụ Nyesom Wike n'ozi ọ gbasara n'ikuku n'ehihie ụbọchị Fraịde kwuru ọtụtụ okwu na-akpọ ogwu n'ahụ banyere ibu agha megide coronavirus na Naijiria. Okwu ndị a mere ka aha ya na-ewu na soshal midia. Lee ihe isii gbara ọkpụrụkpụ o kwuru nke mere onye ọbụla ji ekwu maka ya: 1. ""Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile ji coronavirus mere okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, taa ha sị na ha bu orịa, echi ha sị na ha ebuzighị ya, ha pụta gwa anyị ọnọdụ HIV ha."" 2. Wike kwuru na a ga-ewepta aha ụlọọrụ niile dị na Rivas steeti bụ ndị gbataara ha ọsọ enyemaka n'oge a. O kwuru sị: ""Ebe a ka ha nọ na-achụ nta ego na-ebute ijeri kwuru ijeri ego mana coronavirus adaa, ha bugawa ego (enyemaka) ebe ọzọ."" ""Ụlọọrụ ndị na-enyereghi steeti anyị aka ugbua e nwere nsogbu a, e gbochaa ya bụ ọgụ, ha ga-anụ olu anyị."" 3. Ọ gwara gọọmentị etiti sị, ""O nweghi ọsọ enyemaka ụnụ gbataara Rivas steeti, ụnụ nọrọ n'Abuja na-etiri m iwu."" ""Agaghị m ege iwu Abuja na-etiri m, ihe m na-ege bụ iwu ndị Rivas."" ""Agaghị m arịọ ha gbatara anyị ọsọ enyemaka. 4. Wike jụrụ ajụjụ sị ""Mmachi ngagharị a dị ugbua ọ bụ maka naanị ndị ogbenye?"" O kwuru na a na-ahụ ụfọdụ ndị ọgaranya ka ha na-agagharị na enweghi mgbochi ọbụla. 5.""Egwu ọnwụ anaghị atụ m, ndị coronavirus gburu, ha ama na ha ga-anwụ?"" Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal midia; @SodiqTade sị na Wike so na ndị gọvanọ na-anaghị atụ ụjọ @BashirElRufai sị na ọ bụrụ gọvanọ ọzọ kwuru ihe ndị a na ọ ga-abanye na nsogbu. Isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja agbaala ọkụ Akụkụ ụfọdụ n'isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' agbaala ọkụ. Ọnụ na-ekwuru ndị Inec bụ Festus Okoye gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Fraịde na ọ bụ ọkụ latrik kpatara ya ọkụ ahụ. Mana dịka Okoye si kwuo, ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbatara na-egbughị oge ọbụla ma gbanyụọ ọkụ ahụ. ""Onweghi ihe ọbụla dị mkpa mebiri n'ọkụ a,"" Okoye kwuru. Ụlọọrụ ndị Inec gbara ọkụ Nke a bụ nke ugboro atọ ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche na-agba ọkụ n'Abuja na nsonso a. Isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego gọọmentị bụ 'Accountant General' gbara ọkụ abalị olemole gara aga. Amabeghi ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba N'ụbọchị Wenezde, ụlọọrụ ndị 'Corporate Affairs Commission' gbakwara ọkụ. Akụkọ na-ekwu na ụlọọrụ dị icheiche edeerela ndịọrụ ha ka na-abịa ọrụ akwụkwọ ịgwa ha ka ha gbaa mbọ na-agbanyụ ihe niile gbasara ọkụ latrik dị n'ụlọọrụ ha tupu ha alaa kwa ụbọchị." afirika-44120766,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44120766,MASSOB ebola gọọmentị etiti ebubo ịgbasa ozi alakụba,Onye ndu otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ BIM n'aha ịchafụ bụ Ralph Uwazururike ekwuputala uche ya maka oke ogbugbu na-aga na mpaghara ugwu Naịjirịa.,"Otu ọzọ na-achọ mwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra O si na ihe butere nke a bụ na gọọmentị etiti na-achọ ị gbasa ofufe alakoba na gburugburu Naịjirịa ga-eme ka ọ ghọọ mba ụka alakoba. Onye na-ekwuchitere otu BIM bụ Mazi Chris Mocha kwuru nke a ebe a na-eme emume nturugo Anaocha emere n'Ọnịcha. N'ọnụ ya ""Cheta na ihe yiri nke a mere n'afọ 1811 mgbe e gburu onyendu ndị Yoruba na Kwara steeti ma nara ọchịchị ebe ahụ rue ugbua"". Ọ sị nke a gosiri na mwakpo ahụ na-eme na Benue, Taraba na Nassarawa bụ ihe yiri ihe a na-achọ ime ọzọ. O ji kwa ohere ahụ ị gwa ndị Igbo ha kpachara anya ma dịkwa njikere n'ihe gbasara nchekwa onwe ha. Ọ sị ""ọ bụ ndị Igbo ka ọgbaaghara si n'ọgụ ofufe na-emetụta karị...ya mere ha ga-eji saa anya mmiri n'usoro a ị gbanwe Naịjirịa dịka mba ụka alakoba"". Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50919804,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50919804,"2019 Prophecies: Amụma e buru na 2019, ndị mezuru na ndị gbara ụka","Dịka afọ 2019 na-abịa na njedebe, BBC Igbo lebara anya n'ụfọdụ amụma ndị ụkọchukwu mara banyere ihe ndị ga-emenụ.","Nnyocha anyị gosiri na ụfọdụ mere , ebe ụfọdụ ghọrọ ka nri gbara ụka n'ihi na ha emezughị. 1. Buhari ga-emeri na ntuliaka 2019- Mbaka, Omale Onye Amuma Emmanuel Omale nke Divine Hand of God Prophetic Ministry dị na Abuja buru amụma na Onyeisiala Muhammadụu Buhari ga-emeri ntuliaka 2019. Fada Ejike Mbaka bụ onye ndu isi otu Adoration Ministry, Enugwu, kwuru na ya amaghị onye ga-emeri na ntuliaka 2019 mana na Atiku abughị ya bụ ""onye nzọpụta Naijiria."" Amụma ahụ mezuru dịka Buhari meriri Atiku na ntuliaka nke e mere n'ọnwa Febuwari afọ afọ 2019. 2. Atiku tinye uchu n'Ugwu Naijiria- Suleiman Johnson Suleiman nke ụlọụka 'Omega Fire Ministries International' nọrọ n'amụma nke ya dọọ Abubakar Atiku nke PDP, onye ya na Buhari zọkọrọ ọkwa na ntuliaka ahụ, aka na ntị ka o tinye uchu karịa na inweta nkwado ndị ugwu na ntuliaka 2019. Nke a mezuru n'ihi na Atiku nwetara ezigbo nkwado na Ndịda Anyanwu Naijiria ma gbaa ọnyụpa n'Ugwu Naijiria. 3. A ga-anwụchi onye zọrọ ọkwa onyeisiala Suleiman makwara amụma na a ga-anwụchi otu onye zọrọla ọkwa onyeisiala. Nke a mezuru n'ihi na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS nwuchiri Omoyele Sowore nke zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha AAC maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmenti tụnye ya na nga ọnwa anọ. 4. Otu onye chịbụrụ gọvanọ ga aga nga- Omale Omale bukwara amụma na otu aka chiburu otu steeti ga-aga mkpọrọ. Nke mezuru dịka Orji Uzor Kalu chiburu Abia steeti nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka a mara ya ikpe imefu ego ndị Abia. Orji Uzo Kalu aka chịburu Abia Steeti Amụma ndị emezughị; 5.Ntọ nnukwu ọgaranya si Ọwụwa Anyanwụ na-azụ ahịa mmanu Omale kwuru na a ga-akpa nkata igbu maọbụ ịtọrọ otu onye nnukwu mmadụ si Ọwụwa Anyanwụ nọ n'ahịa mmanu nke ga-ebute ọgbaghara a ga-eji gbaa ahịa a ma ama ọkụ. Ahịa Onicha na Balogun dị na Legọs gbara ọkụ mana o nweghị ka o siri metụta ọgaranya Igbo ọbụla. 6. Ndịagha ga-enupu isi- Ayodele Primate Elijah Ayodele bụ onye ndu INRI Evangelical Church Primate Elijah Ayodele nke INRI Evangelical Church mara amụma na ndị agha Naijiria ga-enupu isi nye ndị isi ha. Nke a emezughị, mana ihe o kwuru na ihe ga-esiwanye ike mezuru dịka ihe ịda oke ọnụahịa na-aga n'ihu. 7. Atiku ga-eweghara ọchịchị n'aka Buhari- Olagunju Wale Olagunju, nke ụlọụka 'Divine Seed of God Chapel Ministries', Sasa,Ibadan mmara amụma na Chineke ga-anara Buhari ọchịchị nyefe Atiku n'aka n'afọ 2019. Nke a emezughị. Buhari ka nọ n'oche ya. Naịjiria bụ ala ọtụtụ ndị nọ na ya ejighị okpukperechi na okwu sị n'ọnụ ndị ndu ha egwu egwu, n'agbagheghị mpụtara okwu ndị ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46407663,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46407663,HIV/AIDS: Ihe mere asọmmiri ejighi ebufeli nje HIV.,Ọrịa HIV bụ oke ọrịa gbapụtara ihe n'ụwa nke gburula mmadụ karịrị nde iri atọ na ise dịka ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO).,"Ụbọchị ncheta ọrịa AIDS na mba ụwa n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba na mpekere akwa ọbara ọbara iji gosipụta emume ya. N'afọ gara aga mmadụ ruru otu nde nwụrụ n'ọrịa HIV n'ụwa gbagburu gburu. Ihe ruru mmadụ nde iri atọ na asaa bu ọrịa a - pacenti iri asaa n'ime ha si mpaghara Afrịka - ebe mmadụ otu nde na ọma asaa butere ọrịa na 2017. Ọ bụ naanị site n'ibute nje HIV bụ otu ụzọ mmadụ ga-eji bute ọrịa AIDS. Kamgbe afọ 1980 ọrịa fesisịrị na mbụ, ọtụtụ akụkọ banyere etu e si ebute ya na etu ọ dị n'ịrịa ọrịa ebutela oke ụjọ n'ime ndị mmadụ. N'ụbọchị ncheta AIDS, anyị na-akọsasị ụfọdụ akụkọ ndị a gbapụtara ihe n'ime ha. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Aga m enwete HIV site n'ịnọkwute onye bu HIV nso Inyocha ọbara dị mkpa iji chọpụta nje HIV n'ọbara Nghọtaghe a ebutela ịkpaoke nye ndị bu ọrịa HIV n'oge na-adịla anya. Agbanyeghi mgbasa ozi megide nke a, n'afọ 2016 pacenti mmadụ iri abụọ na mba UK ka kwenyere na ana-ebufe ọrịa HIV site na mmetụta ahụ maọbụ n'asụ mmiri. Mana a naghị ebute ya site na mmetụ ahụ, anya mmiri, okpomọkụ, asụ mmiri na mammịrị. Ị gaghị ebute ya site: Na 1991, Adaeze Diana nke Wales zutere onye bu HIV na London iji kọsasịa akụkọ ibufe ọrịa HIV A na-ebufe HIV site na mmiri si n'ime ahụ onye bu ọrịa HIV dịka ọbara, mkpụrụ nwa, mmiri si n'ime ahụ nwaanyị na mmiri ara. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Ọgwụ ọdịnala ga-agwọli HIV Nke a abụghị eziokwu. Ịṅụ ọgwụ ọzọ, ịsa ahụ na ngwụcha mmekọrịta maọbụ gị na onye na-amaghị nwoke maọbụ nwaanyị agaghị egbochi ọrịa HIV. Akụkọ ifo amaghị nwoke 'maọbụ nwaanyị' nke mere na mpaghara Sub-Saharan Afrịka, India and Thaịland, dị ezigbo egwu. O meela ka a wakpo ụmụaka ụmụnwaanyị n'ike ma tụnye ha ime. Mana a naghị ebute ya site na mmetụ ahụ, anya mmiri, okpomọkụ, asụ mmiri na mammịrị Maka ekpere nakwa ịtụ aja ime mmụọ nke na-enyere ndị mmadụ aka ịgafe ọnọdụ ọjọọ mana onweghi ihe ọ na-eme n'ahụike onye bu HIV. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Anwụnta na-ebusa HIV Agbanyeghi na ana-ebufe HIV site n'ọbara mana nyocha ekwuola na agaghị ebute ya site n'ụmụ ahụhụ n'amị ọbara, maka ihe abụọ: 1)Ụmụ ahụhụ taa, ha na-amịfe ọbara onye nke mbụ ha tara n'ime ahụ onye nke abụọ. 2) HIV na-adị ndụ naanị n'obere oge n'ime ahụ ndị a. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Agaghị enwete HIV ma yiri okpunabuenyi Okpunabuenyi nwereike ida n'ọrụ igbochi HIV ma ha gbawa, gbụpụ n'oge mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Mgbasa ozi banyere HIV abụghị naanị ka ana-eyi okpunabuenyi mana ka-enyocha ha ahụ maka HIV ma nata ọgwụgwọ maọbụrụ ha bu nje HIV. Dịka WHO si kwuo, otu onye n'ime mmadụ anọ ma na ha bu HIV. Nke mere o ji mfe ibufe ya. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: HIV enweghi ihe mgbaama Mmadụ nwereike inwe HIV rue afọ iri maọbụ iri na ise na-egosighi ihe mgbaama ọbụla. Ha nwereike ịhụta obere ahụ esighi ike gụnyere oyi, isi ọwụwa, ọkọ maọbụ ọnya n'izuụka nke mbụ o butere ya. otu onye n'ime mmadụ anọ ma na ha bu HIV Ihe mgbaama ndị ọzọ nwereike ịpụta dịka nje a na-ebuso ahụ mmadụ agha: otuto ahụ, ọdịda n'arọ mmadụ, oyi, ọnyụnyụ na ọgbụgbọ. Ọ bụrụ na-agwọghị nke a, onwereike ibute oke ọrịa ndị dịka ụkwaranta, 'cryptococcal meningitis' nakwa nje baterịa dị iche iche na kansa ndị dịka 'lymphomas na Kaposi's sarcoma' na ndị ọzọ. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu: Ndị bụ nje HIV ga-anwụ n'oge. Onye ọbụla ma na ya bu nje HIV ma nata ọkwụkwọ ka okwesiri ga-ebi ndị nke ọma. UNAids kwuru na HIV na-ezo n'obara n'ọnụọgụ mmadụ ruru pesenti 47 bụ ndị bu ya bụ nje nke bụ na-agaghị ahụ ya ma achọwa ya Ndị HIV zoro n'obara agaghị ebufeli ya onye enweghị ya bụ nje ma ha nwee mmekọ. Ụmụnwaanyị nje HIV zoro n'ọbara ha nwere ike ụmụ nwa n'ebufeghị ya nwa ha Agbanyeghị, ọ bụrụ na ha kwụsị ịṅụ ọgwụ ha, ya bụ nje nwere ike ịgosiputakwa ọzo n'ụle. Dịka WHO kwụrụ, ọnụọgụ mmadụ ruru nde iri abụọ na otu (21.1) bụ ndị bu ya bụ nje HIV natara ọgwụgwụ n'afọ 2017. Nke a karịrị mmadụ nde asatọ bụ ndị natara ya bụ ọgwụgwọ n'afọ 2010, ya bụ pesenti 78 bụ ndị ma na ha bu ya bụ nje. Nkwenye ndị mmadụ na-abụghị eziokwu:: Nne bu HIV ga-efelata ya nwa ya Nke abụchaghị eziokwu. Nne nje HIV zoro n'ọbara ya nwere ike ịmụ nwa na-ebufeghị ya nwa ya. Akụkọ ga-amasi gị" afirika-51961540,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51961540,Coronavirus: Ihe dị iche n'ọrịa a na azụzụ nkịtị,Ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ama onye nwere ọrịa coronavirus bụ ahụ ọkụ na ogologo ụkwara.,"Mana ọ pụtaghị na onye ọbụla ahụ ya dị ọkụ nwere ọrịa ahụ. Ọpụtaghịkwa na onye ọbụla na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere bu nje corona virus. Ọ bụrụ na ị na-ama uzere ugboro ugboro, maọbụ na imi gi na-agụpụta, maọbụ na isi na-awa gị, o nwere ike ịbụ azụzụ nkịtị, mana ọbụghị coronavirus. Ngwa lee ihe dị iche na nnukwu 'B' na ọkpa ehi. Ahụ ọkụ Ahụọkụ coronavirus bụ mgbe ekpomọkụ ahụ mmadụ gafere digrii 37.8. Mana ọbụghị mmadụ niile nwere tamomita e ji amata etu ekpomọkụ ahụ dị. Ya mere, ọ bụrụ na obi gi na azụ gị ka dị ọkụ karịa akụkụ ahụ gị ndị ọzọ, mara na ị ga-aga nnyocha. Ụkwara Ọ bụrụ na ị na-akwapụta ihe na-alọ alọ mgbe ị kwara ụkwara, mara na ọ bụghị coronavirus kpatara nke a. Ọ bụrụkwa na ụkwara gị bụ ịkwaa taa ọ laa echi, ọbụghị coronavirus. Ụkwara coronavirus bụ nke na-akwa mmadụ ogologo oge, na-enweghị ihe ọbụla onye ahụ na-akwapụta. Bekee na-akpọ ụdị ụkwara 'Dry Cough'. Ihe ị ga-eme Ndị NCDC kwuru na ha nwere ndịọrụ ahụike a zụrụ nke ọma maka igbochi ọrịa dịka coronavirus Ọ bụrụ na gị maọbụ onye ị ma nwere ụdị ụkwara a nakwa ụdị ahụọkụ a, lee ihe ị ga-eme. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị" afirika-46570874,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46570874,Charly Boy: Ọ bụghị alụkwaghịm kama ọ bụ inwogharị ịhụnanya anyị,"Charly Boy kwuru na ọ bụ inwogharị ịhụnanya dị n'etiti ya na nwunye ya bụ Diane ""Lady D"", ka ọ chọrọ ime na ọ bụghị ịgba alụkwaghịm.","Charlyboy na Nwunye ya, Diane, alụọla n'ihe ruru afọ iri anọ. Charly Boy kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya n'ekwentị ịjụ ihe mere o ji dee na soshial midia na ọ chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma lụgharịa nwaanyị ọzọ. N'elu soshal midia, o dere na ọ na-agba nwunye ya alụkwaghịm makana ""ha abụọ ahụchaala onwe ha, na oge eruola maka ihe ọhụrụ"". End of Twitter post, 1 Ka BBC Igbo jụrụ ya ajụjụ a, o were olu ọchị sị ""ehenụ! Anaghị m alụzị makana anọọla m ebe ahụ afọ iri anọ, anyị asị ka anyị ""chenjikwaanụ gear"". ""Mana mmadụ ole ghọtakwaranụ na ọ bụ otu onye ahụ ka m na-aga ịlụ? ""Ị ga-agba alụkwaghịm n'otu ụbọchị ma lụọ nwaanyị ọzọ n'echi ya? Enwerenu etu ọ dị. M na nwunye m na-alaghachị n'ụlọọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya anyị kpebiri afọ ole gara aga."" O kwuru na onweghi mgbe ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm kama na ndị mmadụ ghọtaghiere ihe o dere n'akara soshal midia. Cheta na Charly Boy na Diane ebiela ihe ruru afọ iri anọ ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ha gburugburu. Charly Boy: Iwe m n'ebe Gọọmenti nọ" egwuregwu-47887564,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47887564,Man United vs Barcelona: A kpọgidela Man U n'obe Old Trafford,Barcelona ekpoteghi aja juru ha aka n'asọmpi ha na Manchester United gbara dịka ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ anya.,"Man United bu ụzọ nwale Barcelona na nkeji isii site na 'free kick' Marcus Rashford gbara, mana mgbidi Barcelona wuru gbochiri nke a ịgafe. Na-atụfughi oge na nkeji iri na abụọ, Leo Messi gbara bọọlụ site na nkọrọ, ebe Suarez mara ya isi dịka ọ na-achọ ịba n'ime neetị. Mana Luke Shaw nke Man United ji ụkwụ kukpuo ya n'ime neetị ndị otu ya. Ogbu opi gụpụrụ goolu ahụ na mbụ kwuo na Suarez bi ebi n'ụlọ ndị Man United, mana nyocha ihe onyonyo VAR gosiri na bọọlụ ahụ bụ goolu n'ezie. Ndị Man United bịara kee nkwụcha nke mere o ji raa Barcelona ahụ ịkpa ike. Na nkeji iri atọ na otu, Chris Smalling nke Man United ji mpi aka kpọrie Messi imi, ọbara si ya n'imi na-apụta. Mana Messi mechara bata n'ọgbọ egwuregwu mgbe e nyochara ya ahụ mata na onweghi oke mmerụ ahụ. David de Gea gbaara onwe ya aka ahịa n'igbochi bọọlụ si n'aka Messi na Philippe Countinho. Mmeri a e meriri Man United ga-eme ya ugboro anọ na-eso ibe ya, n'ime asọmpi ha gbarala n'okpuru Ole Gunnar Solskjaer dịka onye nchịkọta ha. Cristiano Ronaldo nyere goolu nke 125 ya n'asọmpi Champions League N'aka nke ọzọ, Cristiano Ronaldo gbara aka ahịa dịka o nyere otu goolu ka Juventus na Ajax zutere. Mana David Neres nke Ajax sara goolu ahụ dịka agba nke abụọ na-amalite. Nke a mere ya otu ọkpụ ha nyeritara onwe ha. N'izuụka na-abịa Barcelona ga-anabata Man United na Camp Nou ebe Juventus ga-ele Ajax ọbịa na be ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51222235,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51222235,Hull City v Chelsea: Chelsea emechiela akwụkwọ n'iko FA,Chelsea mere ihe a tụrụ anya n'aka ha n'asọmpị iko FA dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie otu Hull City mgbe ha zutere onwe ha.,"Michy Batshuayi bụ ụzọ meghe ụzọ goolu dịka o nyere nke ya na nkeji 6 n'agba nke mbụ. Fikayo Tomoro bụ ọgba bọolụ Naịjirịa nyekwara ya aka na nkeji 64 mgbe o nyere ọkpụ mere ya nke abụọ. Kamil Groscki nke Hull City nwara ịhichapụ ihere n'ihu otu ya na nkeji 78 mgbe ọ gbahyere ọkpụ na neeti ndị Chelsea. Chelsea mechara buru ndị mmeri dịka asọmpị ahụ bịara na njedebe. Inec emegharịala ntuliaka na steeti iri na otu taa Ngalaba na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC amalitela imegharị ntuliaka na Abia Imo Kaduna Ogun na steeti asatọ ndị ọzọ. Steeti ndị a bụ Imo, Abia, Cross River, Akwa Ibom, Kaduna, Bauchi, Niger, Kano, Sokoto, Benue nakwa Ogun steeti. Ọkwa ndị ntụliaka mmegharị metụtara gụnyere onyeisi okpuruọchịchị, ọkwa ụloomeiwu ukwu nakwa ụlọomeiwu steeti. Anyị nụrụ kepu kepu na ọgbaghara dapụtara n'ụfọdụ ebe mana onwebeghị ihe akaebe gosiri na ọ bụ eziokwu. Ozuola bụ na ozuola! N'aka ọzọ ndị obodo Sabon Tasha na Juji dị na Kaduna steeti emeela ngagharịiwe maka ntọ atọrọ otu nwaanyị na ụmụ ya abụọ na mpaghara ahụ Ụlọntaakụkọ Channels kọwara na ndị uweojii ekwubeghi ma ihe a mere n'ezie ebe mana ndị obodo ahụ gara ihu gbochie okporoụzọ ebe ụgbọala si agbafe Na mba ofesi Ndị mba Chaịna na-eme emume afọ ọhụrụ ha nke 2020 ha kpọrọ ""Afọ Oke"". Nkwenye ha bụ na dịka oke si a mụ ọtụtụ ụmụ, ngozi ha n'afọ a ga-adịkwa ọtụtụ ka ụmụ oke. N'egwuregwu, Kelechi Iheanacho ejirila otu ọkpụ goolu zọọ ndụ otu Leicester City ma kwanye ha n'agba nke ise n'Asọmpị FA Cup. Nke a mere ka aha ya malite iwu n'elu soshal midia dịka ndị mmadụ na-ebunye ya ụkpa ekele maka ihe o mere. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị ọrụ ahụ ike niile meturu nwaanyị bu ọrịa Lassa aka agaala ezumike mgbochi? Dịka ndị ụlọ ọrụ Parklane Enugwu na-eme nyocha ndị ọrụ ahụ ike ha niile metụrụ nwaanyị ịba Lassa gburu aka n'Enugwu, kepu kepu na-eru anyị ntị bụ na ha amanyela ndị niile metụrụ ya aka ka ha gas ezumike mkpụrụ ụbọchị 21. Otu onye dọkinta so na ndị iwu a metụtara gwara BBC Igbo na ha niile na aṅụzị ọgwụ mgbochi ọya bụ Post Exposure Prophylaxis n'olu bekee iji were gbochie ha ịnweta ya bụ nje Lassa Fever. Okwuru na ụbọchị iri abụọ na out gachazia, ha niile bụ ndị gaara ezumike mmanye ahụ nwezịrị ike bido ọrụ ha n'ihi na oge ahụ ka ọ ga edo anya na ha ebughi ya bu ọrịa Lassa fever. Dokinta ahụ na-ekweghị ka akpọọ aha ya kwuru na obi anaghị akụ ya n'ihi na onwere oluleanya na onwegji onye bu ya bụ ọrịa. Mgbe BBC rutere na Park Lane Enugwu, ọgwụ mgochi ahụ a na-agba na gburu gburu ụlọ ọgwụ ahụ abịala na njedebe ebe ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ malitekwara n'uju ọzọ. Onweghi onye na-ekwuru ụlọ ọgwụ kwere itinye ọnụ n'atụmatụ a. Akụkọ ka na-abịa. N'okwu nje kwa, ọnụọgụ mmadu ọrịa Coronavirus gbugoru agafeela iri na isena mba Chaina dika ya bu nje na agbasa na mba ahụ nakwa mba ụwa. France, Briten, Australia, Amerịka, Thaịland, Singapore, Nepal, Japan, Vietnam, Taiwan na South Koria so na mba nwere ndi ofesara. Ejila aka gị goo igwe ọkụ ọha - NERC Ngalaba na-ahụ maka okwu ọkụ latrịk bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (Nerc) ekwuola hoo haa na onye ọbụla ndị na-enye ọkụ latrịk bịara sị ya weta ego weta transformer gbara bịa gwa ha. Ha sị na nke abụ makana ọbụghị onye na-ego ọku ka ọdịrị igota ihe ndị a. N'egwuregwu, Minista na-ahụ maka egwuregwu na mba Briten bụ Nigel Adams na-ekwusiike na aka ụlọ ọrụ chaa chaa akarịala na asọmpị bọọlụ. Nke na-abịa ka ndị mmadụ gbarụrụ ihu na eresiri ụfọdụ ụlọ ọrụ chaa chaa ikike igosi asọmpị bọọlụ n'intaneti." afirika-55576442,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55576442,Anambra State: Igwe Kelly Nzekwe nke Igbariam alakwurula ndị ichie,"Eze ndị Igbariam dị n'Okpuru ọchịchị Anambra-East bụ Igwe Kelly Nkeli Nzekwe a ma dịka Okalakwu Igbariam, anwụọla.","Igwe Kelly nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na Nnewi n'ụbọchi Tozde ka ọ rịachara ahụ obere oge. Igwe Kelly so na ndị eze ọdinala iri na-abụọ Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano kwụsịburu ọrụ maka iso Arthur Eze gaa n'obi Gọọmentị etiti n'Abuja ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari. Nke a bụ maka na ha anataghị ikike n'aka Gọvanọ Obiano mee njem ahụ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2020. Mana Obiano kpọghachiri ya n'ọkwa n'abalị mbụ nke afọ 2020. Dịka o megidere omenala ụfọdụ ikwu na Igwe obodo nwụrụ na-emeghị omenala kwesịrị, otu n'ime ndị ichie obodo Igbariam bụ Chief Lawrence Anikpe, Ọnwa Igbarịam, gwara BBC Igbo na ""Igwe Kelly jere ife."" Ichie Anikpe kwuru na ""Igwe Kelly gbachaa ọfala nke e hiwere ka anyị ga-agwa ndị mmadụ ebe ọ jere."" Ọ kọwara na ""ọ bụ n'abalị mbụ nke ọnwa jenụwarị ka o kwesiri ịgba ọfala mana anyị akwadoro ọfụma n'ihi na a kwụsitụrụ ya ọrụ."" Nke a mere ka e higharịa ya gawa n'ọnwa Maachị"" 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze' Ọ kọwara Igwe Kelly dịka ""Odogwu nwoke Chukwu wepụtara n'Igbarịam."" Tupu ọ nwụọ , Igwe Kelly bụ ojiegoachụego a na-anụ aha ya. Arthur Eze kwanyere Gọvanọ ugwu ruru ya - Chris Ngige Anikpe kọwara na Igwe Kelly nwere ọtụtụ ụlọọrụ gụnyere Belinda Oil & Gas na Oguegbuna Transport. Kemgbe akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe, ụfọdụ na-ekwu na ọbụ obi nkoropụ n'ihi esemokwu dị n'etiti Igwe Kelly na Gọvanọ Obiano. Mana Kọmishọna mgbasaozi Anambara steeti bụ Don Adinuba kwuru na ọ bughị eziokwu. O kwuru na ọ bụ akụkọ nke ụgha ndị nkwado aka chiburu Anambra steeti na-agbasa na soshal midia. Adinuba gara n'ihu kwuo na e liela Igwe Kelly nke obodo Igbariam a nwụrụ anwụ. N'otu aka ahụ, Ichie Anikpe kwukwara na ""ọ bụghị eziokwu"" na e nwere esemokwu dị n'etiti Gọvanọ Obiano na Igwe Kelly. Ọ kọwara na Gọvanọ kwụsịburu Igwe Kelly ọrụ maka ịga n'Abuja izute Buhari ""mana ha ekpeziela nke mere ka akpọghachite ya n'ọkwa ya."" Na nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọchịchị Gọvanọ Obiano, na-ahụta Igwe Kelly dịka onye na-akwado aka chiburu Peter Obi. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53071366,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53071366,APC Primaries: Azịza ndị APC abaala Osagie Ize-Iyamu n'aka n'Edo steeti,Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Osagie Ize-Iyamu abụrụla onye ga-anọchite anya pati All Progressives Congress (APC) na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo steeti.,"Nke a na-abịa dịka Hope Uzodinma bụ gọvanọ Imo steeti nakwa onyeisioche na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ APC, kwuputere nke a na Benin, Edo steeti. Uzodinma kwuru na ha ji usoro ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) wepụtara, n'agbanyeghi na ụfọdụ ndị ọzọ zọsara ya ọkwa a kwụsịrị n'ụzọ tupu e mee ya bụ ntuliaka. Ize-Iyamu bụkwa ụkọchukwu nwetara vootu 27,838 nke mere ya onye mmeri. Lee etu e si họpụta ya ebe a: Etu ntuliaka ime ụlọ APC si gaa n'Edo Steeti Pati All Progressive Congress (APC) amalitela ntuliaka imeụlọ iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa gọvanọ n'Edo Steetị. Ntuliaka a na-eme n'ime wọọdụ dị otu narị na iri itoolu na abụọ n'ime okpuru ọchịchị dị iri na asatọ nke Steetị ahụ. Otu pati APC Abia steeti agbakọla aka họpụta Buhari maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 Ndị ọrụ pati ahụ nakwa ndị nnọchịteanya bịara n'oge n'isiụlọọrụ pati ahụ nke wọọdụ 7 nke Oredo dị n'okpuru ọchịchị Benin. Onyeisioche wọọdụ ahụ bụ Osamudiame Osarenkhoe sị ha na-eso ntuziaka maka mgbochi coronavirus na-eme ntuliaka a. Ọ sị na e nwere ite mmiri e ji akwọ aka nakwa na onye ọbụ yi akwa mkpuchi ihu. Na wọọdụ 3 nke dị n'okpuruọchịchị Auchi, ndị otu APC pụtakwara ị bịa binyeaka iji họpụta onye dị ha n'obi. APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu Akụkọ ka na-abịa... Kedụ onye bụ onyeisioche APC n'etiti Ajumobi na Gaidom? Egwu agwara ọgwa bụ ihe na-ada n'otu APC dịka Victor Gaidom weghara ọkwa dịka onyeisioche pati ahụ. Nke a na-eme dịka ndị isi pati ahụ nọrọ ụnyahụ bụ Tuzde wepụta Ajụmọbi bụbu gọvanọ Oyo steeti ka ọ bụrụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi oche pati ahụ. Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja kpebiri na nchutu ụlọikpe ukwu chutuburu Adams Oshimhole n'ọkwa ahụ bụ ihe dabara adaba. Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa e werela ọnọdụ na isiụlọọrụ pati ahụ iji hụ na ọgbaghara adapụtaghị. Kedu ihe Ajimobi kwuru? Onye ndị otu APC họpụtara ka ọ bụrụ onyeisi ha bụ omeiwu Abiola Ajimobi ekwuola ka mmadụ niile dere duu. Onye na-ekwuchitere Ajimobi bụ Bolaji Tunji kwuru sị "" Ajimobi kwuru na ọ ga-ekpebi ihe niile mgbe ha ga-enwe nzụkọ pati ha nke ha na-akpọ nzụko ""National Executive Council"". Tunji kwukwara na akụkọ na-ekwu na Ajimobi n'ute ọrịa nke 'ọ dị ndụ ọnwụ ka mma' bụ ezigbote asị. Kama Tunji azaghị eee maọbụ mba maka kepukepu na Ajimobi bu ọrịa coronavirus. Kedụ kwanụ ebe Victor Giadom kwụ? Mazi Victor Giadom onye mere onwe ya onyisioche otu pati APC kagburu nyocha nzụkọ patị ahụ hiwere iji nyochaa ndị ha ga-ahọpụta onye ga-azọ ọchịchị Govanọ Edo steeti. Nzụkọ nyocha a wepụrụ Gọvanọ Godwin Obaseki dịka onye ga-anọchite patị ahụ n'oche gọvanọ Edo steeti, kama Giadom kagburu mpụta nyocha ha dịka ọ mere onwe ya onyeisi. Giadom kwuru na omegidere okpukpe ikpe ga onye achụpụru dịka onyeisioche patị bụ Adams Oshimole ị sọ mee nyocha n'ihi na onwere ihe ọ ga-erite na ya bụ ikpe. Gịnị ka ndị patị APC na-ekwu maka ihe ndị a niile? Ndị otu pati APC depụtara n'akara twiter ha na ọ bụ Abiola Ajimobi ga-arụ ọrụ dịka onyeisioche. Ha kwuru na nke a bụ maka na ha enyochala iwu patị ha dịka o si dị n'agba nke 14.2 akwụkwọ iwu ha, were kpebie na ọ bụ Ajimobi ga-ewere ọnọdụ dịka onyeisioche. Ka nke a na-eme ka Gọvanọ Obaseki gbara arụkwaghịm na patị APC dịka ya na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere nzụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tuzde. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" media-43890265,https://www.bbc.com/igbo/media-43890265,Ebere Buhari na-emere ndị Benue enweghị isi na ọdụ,"Otu akpọrọ Movement for the Actualisation of the Soverign State of Biafra, MASSOB, akọwala ebere ahụ na itiaka n'obị nke onyeisiala Buhari mere ndị Benue dika menemene n'ihu kwampiti n'azụ.","Ndị otu MASSOB na-achọ ka gọọmentị etiti gere ha nti n'ọchichọ nwereonwe ha Ndị a na-eche na ha bụ ndị na-achị ehi gburu mmadụ iri na itoolu (19) nke gụnyere ndị ụkọchukwu abụọ. MASSOB kwuru na ebere ahụ onyeisiala mere bụ ọchịeze nyere ndị otu Kristi. Onyeisiala Buhari zigara ndị Benue steeti ozị itiaka n'obi maka ndị egburu na steeti ahu Onyendụ ndị otu MASSOB bụ Uchenna Madu kwuru na ọ bụ ikwaemu na Buhari so n'ọnyeisi ndị na-achị ehi na-eme ebere ebe ndị otu ya gburu mmadụ. Ha sị na-udị ebere ahụ enweghị isi. Ozi ndị MASSOB kwuru na ""anyị ma na otu chịkọtara ndị na-achị ehi bụ Miyetti Allah bụ ọtu nke anọ kacha njọ na ndị ọmekataraihepuujọ bekee kpọrọ terrorists nke jị ịchị ehị ezochị onwe ha"". ""ndị otu na ndị nkwado ha nke gunyere ndị ụka alakuba, ndị omenala, na ndị ọnụ na erụ nokwụ aṅụọla iyi na ha agaghị ekwe ndị iro ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko"". "" Ha kpọrọ ekwo nkụ na ọchịchị Buharị ga na aga n'ihu makwa n'emezukwa atụmatụ onyeisi ha bụ Othman Dan Fodio"". MASSOB kpọkuru ndị Benue nakwa ndị otu Krisit ka leghere ebere ahụ onyeisiala mere ha maka na ""o jị aghụghọ ekwuchitere ndị ọchị ehị na arụ ahụ ha kpara"". Ndị otu a bukwara amụma na Buharị ga nyefe onye ụka alakụba ibe ya ọchịchị ma ọchịcha nke onweghị onye pati APC sị ala Igbo ga-akwụsịnwụ. Ha kwuru na ""Chibuike Amachi, Rochas Okorocha, Ogbonnnaya Onu, Chris Ngige na ndị Igbo ọzọ nọ na pati APC bụ ndị oje ozi ha n'enweghị ọnụ okwu"". Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-50690191,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50690191,Manchester City vs Manchester United: Man Utd bụ Eze ama n'obodo Manchester,Ndị Manchester United egosila na agadị nwaanyị anaghị aka nka na-egwu ọ ma agba dịka ha ji okpu goolu abụo astara otu were merie ndị Manchester City.,"Manchester United egosila Manchester City na ọ bụ ha bụ Eze Nke a bụ mmeri nke mbu ndị otu Manchester United na-enweta na abụghị na 'Old Traford'. Na nkeji nke abụo n'agba nke mbu ka Raheem Sterling mere ka ọ chọro iyija ndị Man Utd mana enweghị ebe ọ gara. Fred na ndị otu ya etipịala ManCity Nkeji nke iri abụọ na atọ ka Man Utd nwetara penariti mgbe Bernardo Silva gbaturu Marecus Rashfor na-etiti ọnụ goolu ndị Manchester City. Rashford gbara ya were ziga Ederson Aba ebe bọọlụ gawara Abakaliki. Nke a kpaliri mụọ ndị Man Utd dịka ha bidoro chawa ndị Man City ọkụ. Anthony Martial mezuru ya goollu abụọ mgbe ọ were shọtụ gbakaa netị ndị ManCity na nkeji nke iri abụọ na itolu. Raheem Sterling gbalịri ike ya mana...ndo Manchester City enweteghị onwe ha tupu agbacha agba nke mbu. Ka agba nke abụọ bidoro, ndị otu a mara onwe ha aka. Kama Nicolás Otamendi ji isi were mepee neti ndị MandUtd na nkeji iri asato na ise. ManchesterCity nwara ike ha ma dịka o siri dị nanị otu ndị ga-abu eze na obodo Manchester - Manchester United. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45332886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45332886,Paul Esemene: Ihe ndị Uweojii Malaysia kwuru maka onye Igbo nwụrụ n'obodo ahụ,"Mgbe Paul Agiliga Esemene hapụrụ ụlọ ya na Vince Hill Condominium na Kuala Lumpur, isi obodo Malaysia n'ụbọchị 28 ọnwa Ọgọstụ, ọ maghị na ọnwụ ga-echere ya na nlọta.","Etu ejima m ji nwúo na Malaysia Mana nwa amadị a lọtara ụlọ ma zute ọnwụ ike. Mazị Esemene bụ ejima, ma bụrụ onye ojiegoachụego aka ya dị na mbụpụ na mbụbata ngwaahịa na Malaysia. Ejima ya bụ Peter Onyeisi Esemene bi na New Dehli, India, gwara BBC Igbo na Agiliga gara ịhụ enyi ya nwoke wee lọta ma zute ndị uweojii n'ụlọ ya. Dịka Onyeisi siri kwuo, ọ maghị ihe mere nwanne ya nwoke jiri gbapụ ọsọ mana ọ sị na o nwere ike imetụta ihe mere o jiri nye ya ego ugboro atọ kemgbe afọ otu na ọkara Agiliga gara Malaysia. Uweojii buputere Paul Agiliga Esemene n'ụtụtụ ụbọchị Tusde ""Enyere m ya ego ugboro atọ maka iji gbapụta onwe ya n'aka ndị uweojii."" Onyeisi gara n'ihu kwuo na aka ndi uweojii Malaysia di n'ọnwụ ejimma ya. ""Ọ bụ ndi uweojii na-achụ ya mgbe ọ dara wee kụọ isi n'ala, ọ bụ ihe gburu ya,"" Onyeisi kwuru na ọ bụ na nke enyi ya ahụ na-adịghị ka nwanne ya gara ileta tupu ihe ike a eme ya. Peter Esemene sị na ọ bụ n'afọ 2016 ka o mere Paul Akwụkwọ ka ọ ga Malaysia BBC Igbo gbara mbọ nweta onye uweojii okwu a dị na-aka bụ Sergeant Samsudeen. O kwuru na ha mere nyocha banyere ihe gbụrụ nwaamadị a wee hụ na ọ bụ ọdịda elu gburu ya. Sergeant Samsudeen kwukwara na ha ka na-eme nyocha ihe kpatara nwaamadị a jiri si n'elu daa. Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ma aka ndị uweojii ọ dị na ọnwụ Agiliga, o kwuru na ha nụrụ na ndị uweojii gara ebe ahụ, mana ọ bụghị ndị nke si n'ụlọọrụ ha bụ Pekan Batu 9. O kwukwara na ha na-eme nnyocha ebe ndị uweojii ahụ si, maọbụ na ha chụrụ ya ọsọ. Nkwọwa ndịuweojii Malaysia mere n'ọnwụ Paul Esemene. Onye Naịjirịa ọzọ bụ agbata obi Agiliga na Venice Hill Condomimium kpọrọ onwe ya Tobechukwu, gwara BBC Igbo na ndị uweojii na-abịa enye ndi isi ojii nsogbu, na-anakọrọ ha ego. Ọ sị na ihe a metụtara akpọmasị agbụrụ, bụ nke Bekee kpọrọ Racism. O kwukwara na Agiliga nwụrụ ọnwụ ike maka ndị uweojii na-achụ ya akwụsịghi ka ha nyere ya aka mgbe o si n'elu ụlọ a na-akpụsa ụgbọala daa. Nwunye Onyeisi Esemene bụ Diana Samantha Esemene gwara BBC Igbo na-agaghị akpachapụ akpọmasị agbụrụ n'ihe mere ọgọ ya nwoke. Okwu nwaanyị Indịa maka akpọmasi agbụrụ BBC Igbo gbara mbọ ka anyị nụ olu ndị ụlọọrụ na-anọchịte anya Naịjirịa na Malaysia bu Nigerian High Commision mana anyị enweteghi ha n'ekwentị. Ndị nwe Agiliga ebidorola nhazị etu a ga-esi bulata ya na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52823796,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52823796,Mbazulike Amaechi: 'Ojukwu emetachaghị ya n'ihe banyere agha Biafra',"Mbazulike Amaechi bụ otu onye n'ime ndị so zọo nnwereonwe Naịjirịa n'afọ 1960, etinyela ọnụ n'ihe gbasara agha Biafra.","O kwuru na ọ gwara Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu na e nwere ebe ọ na-emetechaghị ya n’ihe gbasara agha a lụrụ. Ọ kọwara na dịka ndị Ugwu na ndị Ndịda kpọkọrọ ndị ọchịchị ha na ndị agha ha ma jụọ ha “kedụ ka a ga-esi mee?” na Ojukwu bịara tinye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị Ọwụwa-anyanwụ dịka Michael Okpara, na nga. O kwuru na ọ bụ ebe a ka Ojukwu si mehie, n’ihi na “Ọ bụrụ na anyị niile sonyere, anyị gaara enwe ụzọ anyị ga-esi kọwaara ndị otu anyị nọ n’Ugwu”. O kwuru na ọ bụrụ na a kọwaara ndị a, na ụfọdụ n’ime ha “nwere akọnauche ga-aghọta ihe mere”. Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Ebere Ekeopara" afirika-50259684,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259684,Operation Positive Identification: Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị - Ndịagha Naịjirịa,Ndịagha Naịjirịa ekwuola na onweghị ihe egwu ọbụla dị na atụmatụ nchekwa ha malitere bụ nke a kpọrọ 'Operation Positive Identification'.,"Ndịagha Naịjirịa kwuru na akụkọ gbasara 'OPI' abụghị eziokwu. Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị gbasara ya bụ atụmatụ. Ha kwuru ka ndị mmadụ ghara ịṅa ntị n'asịrị nke na-efegharị nke na-ekwu na ndị agha na-akwado imekpa ndị ọha obodo ahụ. N'akara 'Twitter' ha ka ha si zipụta ozi a n'ụbọchị Satọdee. End of Twitter post, 1 Ha kọwara na 'Operation Positive Identification' bụ iji kwadoo 'Operation Lafiya Dole' nke na-aga n'ihu na mpaghara ugwu. Mmechi 'Border' Onyeisi Custom bụ Hameed Ali Ngalaba na-ahụ maka ntụbata ahịa na Naịjirịa bụ 'Nigeria Customs Service' na-ekwu na ha anwụchiela ngwaahịa ọnụ ego ya karịrị tarị naịra abụọ na ụma bụ nke ndị mmadụ chọrọ iji azụ ụlọ bubata na Naịjirịa kamgbe e mechiri border. Onye kwuru nke a bụ Joseph Attah bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ mgbe onye ntaakụkọ 'Punch' gbara ya ajụjụ ọnụ. Atta kwuru na ngwaahịa ha nwụchiri gunyere mmanụ petrol, akpa osikapa, ụgbọala, ọgwụ ike, egbe, mgbọ egbe na ihe ndị ọzọ dị icheiche. Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Cheta na Naịjirịa mechiri oke ala ya na mba ndị gbara ya gburugburu n'ọnwa Ọgọst 2019. Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nke ahụ bụ iji gbochie mbubata ahịa n'ụzọ ezighi ezi. Otu onye nwụrụ n'ime ụlọ dara na Legọs Onyeisis ndị ọrụ gbata gbata na Legọs steeti bụ Dọkinta Oke-Osanyintolu sị na otu onye n'ime mmadụ ise ụlọ dachiri n'Ikoyi dị na Legọs nwụrụ anwụ tupu a gụpụta ya. Mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ nọzị anata ọgwụgwọ ugbua. Dọkinta Dr Oke-Osanyintolu sị na nyocha izizi ha gosiri na ọ bụ ngwa ọrụ adigboroja na ndị ọrụ amaghị arụ butere ọdịda ụlọ a, m kwukwa na ha ka ga-eme nyocha ịmata nke bu eziokwu. Onyeisi Lasema bụ Dọkinta Oke-Osanyintolu na Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ gara ebe a ụlọ a dara Ọ si na ndị ọrụ ya bụ ndị ogige ha bụ ""Lagos State Emergency Agency"" (LASEMA n'ịchafụ) ga-alaghachite ebe ọdachị a dara ịga hụ na ya bụ ụlọ abụghịzị ihe ga-etinye ọha na nsogbu. Dịka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ a nwụrụ siri gwa BBC, onye nwụrụ dina n'ime ya bu ụlọ ararụ ụra maka ahụ adịghị ya mgbe ọdachị a dara. Ndị ọrụ gbata gbata amalitela ịkụtụ ụlọ ọzọ na nso ebe nke a dara dị, dịka onye ntaakụkọ BBC hụrụ ya siri kwuo. Ụlọ a na-akụtu n'Ikoyi Ntụlịaka Bayelsa na Kogi Steeti INEC na akwado ntụliaka na Bayelsa na Kogi steeti Onyeisioche ndị INEC bụ Mahmood Yakubu etiela mkpụ na enwere ike inwe nnụkwụ ogbaaghara na ntụliaka a ga-eme na Kogi na Bayelsa steeti maka ndị omekome na akwado ibute ọgbaaghara. Yakubu kwuru na oruola onwa asaa ha bidoro ikwado maka ntụliaka a ma sị na ha agaghị ekwe ka enwe ihe ọdachi ọbụla. Kama onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Abubakar Mohammed Adamu gwara Yakubu na ha dị njikere ichekwa ihe niile gbasara ntụlịaka a. Adamu kwuru na ha ezipụla ndị uweojii puku iri atọ na ise na narị abụọ gawa Kogi ebe ha zipụru puku iri ato na abụọ na iri anọ na otu gawa Bayelsa. EFCC Onye nọ dịka onyeisioche ndị EFCC bụ Ibrahim Magu ekwuola na ha ga-ebido inyocha ndị Dọkita na-enye akwụkwọ adigboroja maka ahuike nke ndị omekome jị agbanagharị ikpe ruru ha. N'aka nke ọzọ ka ndị EFCC nwuchiri mmadụ iri na isii bụ ndị isioche okpuruọchịchị dị na kwara steeti maka imefu ijeri Naira anọ n'ụzo na ezighị ezi. EFCC gwuru na mmadụ iri na isii a bitere nde naira anọ were kpebie na ha ga-eke otu narị nde naira na etiti ha. N'ofesi Ndiagha mba Mali mmadụ iri anọ na itoolu tufuru ndụ ha mgbe ndị otu oyi egwu wakporo ha na abalị Fraịde. Amabeghị ndị otu kpara arụ a mana a na-arọ anya na otu akpọrọ Ansaru Islam bụ ndị aka ha dị na ya. Ikuku ọjụo na enye ndị New Delhi nsogbu Gọọmentị India ekeela ụmụakwụkwọ ihe eji ekpuchi imi ruru nde ise maka ajọ ikuku jụpụtara na New Delhi. Minista New Delhi bụ Arvind Keriwal kwuru na ọ bụ ahịhịa agbara ọkụ na steeti ndị ọzo na ebute ajọ ikuku a. N'Egwuregwu Otu egwuregwu Rugby nke mba Saụt Afrịka eturula ugo n'asompi iko mba ụwa nke afọ 2019 bụ nke a gbara na mba Japan. Saụt Afrịka meriri mba Ịngland iji mabulie ya bụ iko. Nke a bụ nke ụgboro atọ ha na-eturu ugo na asọmpi iko mba ụwa na Rugby. Ha gunyere afọ 1995, 2007 na 2019. Ndị otu egwu bọolụ Naijirịa bụ Golden Eaglets dara ọnyụpa dịka ndị Australia ji ọkpụ goolu ha satara otu merie ha na asọmpị iko mba ụwa nke ndị ntoroobia. Na agbanyeghị nke a, golden Eaglets ga eso gbaa agba nke anọ na asọmpị a. Gee nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkịrị ga-amasị gị 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" 42788349,https://www.bbc.com/igbo/42788349,Manchester United ka bụ igwe kacha ebiri egwuregwu bọọlụ ego,"Manchester United bụ nke mbụ n'ọkwa ndị otu iri abụọ kachasị nwee ego na egwuregwu bọọlụ n'ụwa, n'ime afọ abụọ a na-eso onwe ha, ma bụrụkwa ugboro iri ha ga-eme ya, dịka Deloitte kwuru.","Manchester United kwụsịrị oge bọọlụ nke Premier League 2016/2017 n'ọkwa nke isii Ndị njikọ nke ego ndị egwuregwu bọọlụ (Football Money League) chọpụtara na n'ime afọ 2016-17, ntụkọta ego Klụb iri abụọ ahụ rịrị ruo pasenti isii nke pụtara Euro ijeri asaa na nde itoolu (€7.9bn), mekarịsịa afọ ndị gara-aga.. Real Madrid nọbụ n'elu n'ọkwa ahụ ruo afọ iri na otu, gbara n'ọkwa nke abụọ ebe Barcelona gbara na nke atọ. Otu iri si na klọb Premier League England so n'ọkwa iri abụọ nke mbụ ndị mekarịchara ọfụma. Ọnụ ọgụgụ ha si na iri na abụọ gbagoruo iri na anọ. Ihe ndepụta a na-egosi nanị ego ole ha kpatara, mana ọ naghị etinye ụgwọ ha ji n'uche. N'afọ a, azọrọ ọkwa nke mbụ a azọ ọfụma, mere Manchester United ji were nanị Euro otu nde na puku narị asaa were gafee Real Madrid. Otu league ise bukarichara Euro nde narị isii na iri asaa na isii (€676m) nke Manchester United kpatara, ritere uru Euro iri anọ na anọ na ise (€44.5m) n'aka UEFA ka ha bulichara iko nke Europa League ka ha na Ajax sọrọ mpi. Ndị Deloitte kwuru sị na ego a bụ ""ihe dị mkpa eji kpebie na ha ga-aga n'ihu karịa Real Madrid na Barcelona"". Ronaldo na Messi na-agbara klọb abụọ so na ndị nọbu n'ọkwa ndị kacha akpata ego bụ Real Mdrid na Barcelona Bayern Munich na Manchester City mechara n'ọkwa nke ise, bụ ọkwa ha n'afọ gara aga. Arsenal, Paris St-Germain, Chelsea, Liverpool na Juventus nọ n'ọkwa nke isii ruo nke iri. Tottenham gbara n'ọkwa nke iri na otu, Leicester City ọkwa nke iri na anọ, West Ham nke iri na asaa, Southampton nke iri na asatọ na Everton gbara nke iri abụọ. Klọb iri abụọ anọchitere anya si na ""ise kachasị ibu"" na league Europe, ebe Italy, Germany na Spain wepụtara klọb atọ ma France ewepụta otu. Ndị njikọ nke ego ndị egwuregwu bọọlụ dịka Delọitte wepụtara" media-47690656,https://www.bbc.com/igbo/media-47690656,"New Minimum wage: ""Ụgwọ opekatampe dị m mkpa""",Kọmiti Muhammadu Buhari kpokobara gbasara ilebanye anya n'ụgwọ opekatampe enyela ya nchọpụta ha taa n'Abuja.,"Onyeisiala Muhammadu Buhari si n'akara Twitter ya kwuo na ihe gbasara ụgwọ opekatampe dị ya mkpa. Ihe ndị ọzọ o kwuru bụ na a na-eche ndi ụlọomeiwu ka ha nye iwu gbasara usoro ụgwọ opekatampe ọhụrụ. Onye na-azọ ọkwa osote Govano n'okpuru otu AAC na Rivas steeti bụ Bomba Yeeh agbahapụla otu ya. O kwuru na ọ bụ n'ihi etu Chibuike Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem siri zọkọrọ ihe niile gbasara ya bụ pati. Cheta na Amaechi pụtara ikwado otu AAC na ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke e mere na steeti ahụ n'ụbọchị 9 nke ọnwa Maachị. Ihe mere na Legọs Gọọmentị Legọs dọrọ ndị mmadụ aka na natị ọ kachasị ndị bi n'ụlọ ndị a na-akwado ị kwatu sị ha gaa chọọ ebe ọzọ biri. Arịrịọ a na-abịa dịka ụlọ ọzọ dara na Legos Island n'ụbọchị nke ga-eme ya ụlọ atọ n'ime izuụka abụọ. O nweghi onye merụrụ ahụ maọbụ nwụọ n'ọdachi nke atọ a. Anyị wuchie n'Imo steeti Ndị otu AA: Peter Igwe, Ikenna Okata, Ifeanyi Opara, Donatus Obiakor, Augustine Anyanwu, Endy Nwanyanwu, Ifeanyi Ejim. Ifeanyi Okponwa nakwa Ekemezie. Haa niile bụ ndị isi okpuru ọchịchị itoolu nke otu Action Alliance machiri maka mmegide iwu na ọchịchị ya bụ Pati. Na mba ofesi, Ngalaba ahụike na mba Kongo ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu puku enwetala ọrịa Ebola ọhụrụ ebe ihe karịrị mmadụ narị isii anwụọla site n'ọrịa a. Ha kwuru na mwakpo a na-eme ụlọ ọgwụgwọ dị icheiche so n'ihe na-eme ka ọnụọgụgụ ndị nwere Ebola na-arị elu. N'egwuregwu, Naịjirịa emeriela mba Libya dịka ha kwatara ya taa n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi n'Asaba. Ha ji ọkpụ goolu anọ asataghị otu dọkaa neeti ndị mba Libya. Victor Osimhen nke aha ya na-ewu na soshal midia bụ onye nyere goolu mbụ. Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị ọnụ na-eru n'okwu gara hụ Nnia Nwodo Nnia Nwodo onyendu Ohaneze Ndigbo Ndị ọnụ na-erU n'okwu n'Alaigbo ebugarala onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ụkpa ekele maka ịkwụsịke ya na atụmatụ Ihazịgharị Naijiria n'agbanyeghị mgba okpuru na ọnwụnwa so ntuliaka 2019. Ndị mere njem a n'ịzụụka a garanụ gụnyere Achike Udenwa, Okwesilieze Nwodo, Azu Agboti, Onyema Ugochukwu , Dubem Onyia nakwa A.B.C. Nwosu bụ ndị kwuru na Ndịgbo mere ka a tụrụ anya na ya bụ ntuliaka. Cheta na Nnia Nwodo n'ozi keleburu Ndigbo maka ndị ha họpụtara na ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti n'Ọwụwa Anyanwụ were sị na ndị a họpụtara bụ ndị ga-akwadọ nhazigharị Naijiria. N'ozi o wepụtara , Nwodo sịrị , ""Asị m ka ha were ohere kelekwa ụnụ ọzọ maka pụta na nhọpụta a họpụtara maka ndị ga-ejere anyị ọkwa gọvanọ na na ụlọomeiwu na steeti dị iche iche. ""Ihe juru m afọ na nhọpụta ụnụ mere bụ ndị ụmụ họpụtara ndị anyị mara na ha ga-akwado Ohaneze gbasara nhazighari Naijiria, ụnụ mere ka anyị siri were kwuo."" Nwodo onye rịọrọ ndị Igbonọ obodo oyibo na ndị jiegoakpataego(businessmen) ka ha bịa jịkọ aka mepee Alaigbo, ""Anyị ga-etibuta be anyị ka ọ bụrụ ihe nkiri na ndị jụrụ anyị kwere, ka ndị na-agbara anyị ọsọ chọrọ anyị bịa."" Ndị kwe ndị ekwe na mmejuputa ntuliaka 2019 Akara njirimara PDP na APC Dịka Jeremiah Useni nke PDP na-ekwu na ya ga-aga ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka gọvanọ Plateu steeti bụ nke Inec kpọpụtara Simon Lalong nke APC dịka onye mmeri, otu APC ajụla mpụtara nke Benue na Sokoto steeti nke Inec sị na ọ bụ otu PDP meriri. Ọnụ na-ekwuru APC na Sokoto steeti bụ Bello Danchadi gwara ndị ntaakụkọ na nrụrụaka karịrị na ya bụ mmezụ ntuliaka e mere na Satọde. Ụlọikpe agọlara Trump Donald Trump boro ndị isiala mba Syria na Rọshịa ebubo maka ihe mere na Syria N'ofesi e, ụlọikpe nnyobe anya ekwuola na ha ahụghị aka Donald Trump nke Amerika na Russia na ịgba ntuliaka mba Amerika mgbaokpuru na 2016. Onyeisioche ya bụ ụlọikpe bụ Robert Mueller ekwughịzị ka o nwere ka Trump siri gbochie ụlọikpe ilebanye anya na ya bụ okwu. Azọgbụọla otu onye na Zimbabwe A zọgburu otu nwoke na ọgbọ egwuruegwu ebe ndị mba ahụ na-ezute Congo Brazaville N'egwuruegwu, a zọgbuola otu onye bịara ikiri bọọlụ na Zimbabwe dịka ndị mba ahụ na ndị Gongo Brazaville pụtara ịma ọkaibe na Iko G nke asompị mba Africa. Zimbabwe ji ọkpụ abụọ asataghị ihe sị ya bụ nwaamadị laa n'udo ma tozuo dịka ndị ga-aga ya bụ asọmmpi na Ijipt. Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-44708883,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44708883,World Cup 2018: England abaala agba anọ ikpeazụ,Mba Ịngland jiri penarịtị merie ndị Kolombịa na Mọsko n'abalị ụnyaahụ.,Eric Dier nyere goolu mmeri oge Jorndan Pickford napụtachara ha n'aka Carlos Bacca. Ịngland ga-ezutezi mba Swidin na Samara ụbọchị 7 ọnwa Julai. Onye nkuzi ndị Ịngland bụ Gareth Southgate kpo ndị ọrụ ya ṅụrịa maka mmeri ahụ dịka ndị ọgba bọọlụ ya na-ekele ndị mmeri ha bụ Pickford na Dier dịka ha nwere mmeri mbụ na agba mgbapụ na asọmpi siriike dịka Iko Mbaụwa kamgbe afọ 2006. Ọ dịka ndị egwu Southgate enweghi ọkọ kọrọ ha n'ahụ dịka ha natasịrị penarịtị nke ajọ agwa nyere Harry Kane mana ndị Yerry Mina nke Kolombia satara ya na ngwụcha asọmpi ahụ nke mere ndị na-akwado Kọlọmbịa ji gbaka n'ọṅụ. E tinyekwuru nkeji 30 mana onweghi onye nyeliri goolu n'oge ahụ nke mere e ji baa na penarịtị. Onweghi mba meriri Iko Mbaụị̀a na mbụ nọ n'etiti Ịngland na agba nke ikpeazụ. Onye meriri n'agba nke anọ ikpeazụ ga-ezute mba Kroeshia maọbụ ndị na-akwa ọbịa Rọshịa maka agba ikpeazụ a ga-egba na Mọsko ụbọchụ 15 ọnwa julai. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 49099190,https://www.bbc.com/igbo/49099190,Nigerian Ministers: Ka o si aga na nnyocha ndị ga-abụ mịnịsta n'Ụlọomeiwu Ukwu,Ụlọomeiwu Ukwu ebidola nnyocha ndị a họpụtara ga-abụ mịnịsta ụbọchị Wenezde.,"Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari zigarala ndị Ụlọomeiwu Ukwu aha ndị ọ chọrọ dịka Mịnịsta ụbọchị Tuzde. Nwa afọ Abịa steeti ahụ bụ Uche Ogah bụ onye mbụ banyere n'ọgbọ dịka ndị omeiwu chara ya ọkụ n'ụzọ pụrụ iche. Mana Ogah sakwara ha dịka onye mara nke a na-akọ dịka o siri gbasaa ụlọakụ, mmepụta mmanụ na ihe ndị ọzọ. Lee ụfọdụ ihe a jụrụ ya na nke ọ sara ha: Ajụjụ a jụrụ Uche Ogah na ọsịsa ya: TSA: Ịnata ego ụlọakụ na- atara gọọmenti. Ọ bụ na o nweghị ka a ga-esi mee ka ndị ụlọakụ na-enweta ego dịka TSA pụrụ ha ara n'ọnụ ? ""Itinye ego na TSA, ego ndị a tọgbọgbọrọ nkịtị, o o nweghị ihe ego ahụ na-eme na ịkwalite akụnaụba."" ""Onye ọbụla mara ihe mere oge e bidoro TSA, ọ chọbụrụ ịkwada ọtụtụ ụlọakụ. O bụ CBN gbatara ha ọsọ enyemaka. Ọ bụrụ na e nye ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka 'Commerce and Industry,' kedụ ihe ị ga-eme ka ịkọlite mmepụta ihe ka ndị na-eto eto nwee ọrụ? ""Ọ bụghị ọrụ gọọmentị iwepụta ọrụ. Ọrụ gọọmentị bụ ime ka ọnọdụ akaụnba dị mma nke na ndị mmadụ , ụlọọrụ ga na-ewepụta ọrụ."" Ọ ka mma imezi ụlọmmanụ(refineries) anyị ka ọ bụ ka ahapụ dịka e mefuruola nde kwuru nde irụzị ya ma arụtaghị ha? ""Agaghị m akwụ ebe gwa ụnụ ka ihe mmebi dị n'ụlọmmanụ anyị ha."" ""Ihe kacha mma bụ ka anyị nwee ụlọ na-esi mmanụ. O kwesịrị ka anyị nwe mkpebi ime ka ụlọmmanụ anyị rụwakwa ọrụ ọsọ ọ bụghị otu a."" ""Ọ bụrụ na ụlọ na-esi mmanụ arụghị ọrụ, n'afọ iri na-abị, anyị agaghị enwe ego anyị ga-etinye n' ọrụ iwu ewuwu na-akwalite akụnaụba Naijiria."" Akume bara klaasị ọhụrụ na eleghị ule Ndị omeiwu agbaghị Senetọ Akụme ajụjụ ka a kpọpụtara ya n'Ụlọomeiwu taa. Ha kwuru na dịka ka si emebu na ha anaghị agba onye bụbu Senetọ ajụjụọnụ. Akpabio wụfere na enweghị mgbochi ọbụla Senetọ Enyinnaya Abaribe kwuru na ya kara etinye otele Akpabio n'ọkụ ma ọ bụghị n'ihi 'omenala' ndị ụlọomeiwu ịhapụ onye bụbu Senetọ ka ọ banye Klaasị ọhụụ na eleghị ule ọbụla. Abaribe rịrịọ ya ka ọ nọchite ha anya nke ọma dịka ọ na-abanye n'ọkwa ọzọ. Onyeisi Ụlọomewu bụ Ahmed Lawan dụrụ Akpabio ọdụ ka ọ gbaa mbọ hụ na mmekọrịta ụlọomeiwu na ndị mịnịsta na aga siriri-werere. Lawan jụrụ ndị otu ya ha ekwenyere ka Akpabịọ nafere na ajụghị ya ajụjụ ọbụla, ha niile kwee, 'Eyeeeh'! Emeka Nwajiụba naferele ka ugo Ndị omeiwu gwara ya gawa n'ihu na enyeghị ya mmaja ọbụla. Nke a bụ n'ihi na nwa afọ Imo steeti bụ okaiwu tinyere obi ọnụ n'ime ọtụtụ n'ime ha ọ kọwara onwe ya na ihe o merela ka a kpọpụtara ya dịka . Ihe ọzọ nyekwara ya aka bụ na ọ rụọla dịka onye nnọchiteanya mpaghara Okigwe South n'ụlọomeiwu Nta. Cheta na Nwajiuba nọbụ na APC si ya wufere Accord Party ebe o siri nweta mmeri ịbanye Ụlọomeiwu Nta. Ndị ụlọomeiwu gara zuru obere ike ma lọghachi. Mgbagha so inyocha Rotimi Amaechi Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Oge ndị Ụlọomeiwu gachara ṅụrụ mmiri ma lọghachi. Mgbe ha lọghachiri, Ahmed Lawan kpọrọ oku ka ndị isi ụlọomeiwu kwuo okwu tupu ha ahapụ Amaechi ka ọ gawa 'n'ihi na ọ bụbu 'Speaker'. Mana 'Minority leader' bụ Enyinnaya Abaribe kwuru na ya na ndị Rivas nọ n'ụlọomeiwu akpaghị maka ị hapụ Amaechi. Abaribe kwuru na ndị Rịvas siri ya ha jụọ Amaechi na ha tụrụ anya na dịka mịnịsta nke Naijiria nke gụnyere Rịvas steeti, ọrụwa ok[poro ụgbọoloko ya chetakwa ndị nọ akụkọ ọwụwa anyanwụ site n'Agbọr were gaa Iyiocha. Ha mechara hapụ ya ka ọ lawa na azaghị ajụjụ ọbụla. Ogbonnaya Onu akụkọ teknụzụ kọjụọ ha anya Ogbonnaya Onu Ogbonnaya Onu were ọnọdụ n'ihu ha ka Amechi pụchara. Ndị omeiwu jụrụ ya ihe o mere dịka Mịnịsta na-ahụ maka nka naụzụ n'ọchịchị Buhari? O kwuru na ya gbalịlị iwelite mkpa ọ dị itinye uchu na Sayensi na teknụzụ. N'ikwu maka mkpa Sayensi dị na mmepe obodo, ọ rụtụrụ aka na ""o nweghị obodo na-emepe ma ọ bụrụ na ha agbasoghị sayensị na teknụzụ."" N'ịkọwa onwe ya, ọ kọwapụtara ihe ndị o merela dịka mịnịsta na-ahụ maka nka na ụzụ na Naijiria na-etu onyeisiala Muhammadu Buhari si nye ya nkwado ime ihe ndị ahụ. Ndị ụlọomeiwu kwekọrịtara ka ọ gawa na-ajụghị ya ajụjụ ọbụla. Olurunnimbe Mamora Nwa afọ Legọs a nọchiteburu Lagos East n'Ụlọomeiwu Ukwu kọwara onwe ya nakwa ọkwa ndị o jiburula. Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Ahmed chetara ndị ogbo ya iwu ha ịhapụ onye nọrọla n'Ụlọomeiwu mbụ ma kpọlite onyeisi ha nakwa onyeisi ndị pekarịrị9Minority leader) ka ha chịkọta okwu. Abaraibe kerele Mamora ""enyere gị ọkwa ekweghị ebe i siri pụta, ị kwanyere anyị ukwu ịjụ ịnata ya."" Ube Olalekan Adegbite eruola Nwa afọ Ibadan eruola dịka ọm kọwarala ndị omeiwu etu o siri bido n'ịrụ na ụlọọrụ nọrọ onwe ya(private sector) bido mgbe ọ nọ na mahadum, were banye ịrụ ọha ọrụ (public service). Adamu Adamu Adamu Adamu bụ mịnịsta na-ahụ maka ọgụmakwụkwọ n'agba nke mbu ọchịchị Muhammadu Buhari A jụrụ ya ihe o nwere ikwu maka ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naijiria dịka ụmụaka gbaghapụụ agụmakwụkwọ Praimarịrị gara elu karịa Sharon Ikeazor zọfere ke enyi nnụnụ Onye ọzọ a kpọpụtara ịzara ọnụ ya bụ Ada Anambra rụrụ ọrụ ya ikpeazụ dịka onyeisi ngalaba ụgwọ ezumike nka a kpọọ Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD) Ọ kọwara ihe ndị niile o mepụtara dịka ọrụ ya siri dị na otu ọrụ ya siri gbanwe ndụ ndị lara ezumike nka. Ka o kwuchara , ndị omeiwu kwekọrịtara ma hapụ ya ka ọlawa ""ihi na ọ bụ nwaanyị."" Ọ bụ ebe ka ndị omeiwu wụsara ọwa ma kpebi ibido ebe ha kwụsịrị ụbọchị Tọzde. Akụkọ ga-amasị gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’? Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro" 45886199,https://www.bbc.com/igbo/45886199,Codeine: Ndị ntorobia na aṅụ ọgwụ ike ka na-azụ ọgwụ a n'ahịa,Ogologo aka iwu ejidela Chukwunonye Madubuike bụ nwoke ahụ putara n'ihe nkiri nke BBC dịka onye na-atụ mgbere ọgwụ Kodin.,"Ọtụtụ ụmụntorobia bụ ndị na-aṅụ ọgwụ a Madubuike gbara ọsọọ̀ ụkwụ eru ala kamgbe ihe nkiri a pụtara ebe ọ gwara onye ntaakuko BBC na ọ ga-eresị ya ọtụtụ ọgwụ kodin na-anataghị akwụkwọ nke a kpọrọ 'doctors prescription' na Bekee. Mana n'ime nyocha ọhụrụ BBC Igbo mere, onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ọtụtụ ụmụntorobia ka na-aṅụ ọgwụike a, a kpọrọ Kodin agbanyeghị na gọọmenti amachiela ọgwụ a. ""Anyi chọrọ ibi ndụ anyị"" Ọtụtụ n'ime ndị na aṅụ ọgwụ ike ekweteghị na njọ dị n'omume a Tony bụ otu ntorobia na-aṅụ ọgụ ike a nke ọma, gwara BBC Igbo na o kweteghị na ọgụ a na-aba n'anya dịka akụkọ BBC siri kwuo. N'ọnụ okwu ya: ""Ekweteghị m n'ozi a makana o teela m na-aṅụ Codeine, nakwa na ọ naghị aba m n'anya site mgbe ahụ ruo ugbua"" ""Ebumnuche anyị bụ na ozi a bụ usoro gọọmentị chọrọ ị kwụsị anyị ị nụ ọgwụ a"" Ego ya eriala elu Tony gwara BBC na akụkọ BBC mụpụtara gbasara Codien emebiela ọtụtụ ihe. O kwuru na: ""Tupu BBC tinyere anya na Codeine anyị na azụ ya puku naira 1,000 maọbu 1,500, ugbua anyị na-azụ ya 3000 maọbụ 3,500"" Mana Chidi kwuru na ọnụdụ ya ka njọ makana ya nwa na-azụ ya puku naira 4,000 maọbụ 5,000. Egwu ka dị Ha abụọ kọwara na egwu na-eji ha mgbe ọbụla a na-aga ịzụ codiene. Tony kwuru na ""Mmu nwa na-aga ụlọorire ọgwụ ndị mara m nke ọma."" ""Ọ bụrụ na ịga ebe amaghị nke ọma, ha nwere ike ị kpọrọ gị ndị uweojii"" Madubuike gbara ọsọ ka ihe nkiri BBC pụtara ihe Onye bụ Chukwunonye Madubuike? Ogologo aka iwu ejidela Chukwunonye Madubuike gbara ọsọ ụkwụ eru ala kamgbe ndị BBC nyochapụtara etu o si ere ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ na-ezighi ezi. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti gwara BBC na ha nwụchiri Madubuike n'ụzọ Idi-Iroko dị n'Ogun steeti, ka ọ na-achọ isi ebe ahụ gbaga Cotonou dị na mba Benin Repọblik. Oti kwukwara na ugbua aka kparala ya, na ihe ga-eso ya bụ ịkpụpụ ya ụlọikpe. Onyeisi ndị uweojii na Legọs steeti bụ Edgal Imohimi gwara ndị ntaakụkọ na Madubuike gwara ha na o rere ọgwụ ndị ahụ iji hụ na o mezuru oke ọrụ oriri na ọzụzụ e nyere ya. O kwuru na ndị ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical Industries Limited bịara kpesara ndị uweojii maka etu Madubuike si na-atụ mgbere ọgwụ megidere iwu ọgwụ Naịjirịa. Cheta na BBC wepụtara ihe nkiri gosiri ka Madubuike na-akpa etu ọ ga-esi resị onye ntaakụkọ BBC zoro ezo, ọgwụ ọtọmegbum. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" 42821146,https://www.bbc.com/igbo/42821146,Thomas Dennerby bụ onye nkuzi ọhụrụ Super Falcons,Otu egwuregwu Super Falcons nke ala Naijiria enwela onye nkụzi ọhụrụ aha ya bụ Thomas Dennerby.,"Thomas Dennerby di afọ iri ise na isi Onye isi otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria bụ Amajụ Pinnick kwuru nke a n'elu Twita. End of Twitter post, 1 Super Falcons emeriela na asọmpi iko ụmụ nwanyị Afrika ugboro asaa Ozigbo ụfọdụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n' anya nụrụ nke a ha bidoro na-ekele Pinnick n'elu Twita. Dennerby bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Hammarby na Sparvagens na oge gara aga. O sokwa na otu ndi egwuregwu bọọlụ ụmụ okorobia dị afọ iri abụọ na otu nke Sweden. Dennerby rụkwara ọrụ ndị uwe ojii. Bụrụkwa onye nkụzi nke otu Allsvenskan na Hammarby na afọ 2001." afirika-44689947,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44689947,Etu ndị uweojii si 'gbapụta' nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ,Ndị uweojii Naịjịrịa kwuru na ndị ntọ atọhapula nna onye nchịkọta ndị otu egwuregwu 'Super Eagles' bụ John Mikel Obi.,"Foto oge a gbapụtara nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ n'afọ 2011 Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu, kwuru na ọ bụ eziokwu na ndi ntọ tọrọla nna Mikel ụbọchị tusde garaaga. Ndị ntọ a manyere nna Mikel sị ya gbara ụkwụ nkiti gaa ije dị anya (ihe ruru kilomita ise) n'ime oke mmiri na-ezonu. Amarizu kwukwara sị na a gbapụtara nna Mikel ka ndị uweojii na ndị ntọ ahụ lụchara ọgụ egbe, tupu ndị ntọ ahụ agbafuo. Ndị uweojii Enugwu steeti dere maka ya na Twitter ha: Mikel kwuru sị na ọ nụrụ na ndị ntọ ji nna ya n'ime elekere anọ tupu asọmpi egwuregwu dị n'etiti Naịjirịa na Ajentina ebido n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa. Akụkọ kwuru sị na a tọrọla nna ya n'ụzọ Makurdi-Enugu, ka o si Jọs na-aga akwamozu n'ọwụwa-anyanwụ. Mikel kwuru sị ka ndị uweojii gbapụtara ya ụbọchị Mọnde, na nna ya nọ n'ụlọọgwụ ugbua na-anata ọgwụgwọ maka na ndị omekome ahụ tara ya ezigbo ahụhụ. O kwuru sị na ọ gwaghị ndị otu ya maọbụ ndị nchịkọta otu egwuregwu Naịjirịa. Ọ sị ""A gbara m bọọlụ ka nna m nọ n'aka ndị ntọ...akwaturu m ihe mgbawa obi ahụ."" Mikel kelere ndị uweojii n'akara Twitter ya: Otu akụkọ kwuru sị na a kwụrụ dọla puku 28 ($28,000) bụ ego mgbapụta nke bekee kpọrọ 'ransom'. Cheta na nke a mere ya ugboro abụọ a na-atọ nna Mikel, makana a tọrọ ya mbụ na Jọs n'afọ 2011. Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala" egwuregwu-44509414,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44509414,World Cup 2018: Denmak emeriela Peruu,"N'ime asọmpi Iko Mbaụwa dị n'etiti Peruu na Denmak bụ ndị nọ n'otu CH, ihe a bụ dịka o si gaa nkeji na nkeji.","Dịka ndị otu bọọlụ Peruu ndị yi uwe ọcha na Denmak ndị yi uwe ọbara ọbara pụtachara, ha gụrụ egwu eji maara mba ndị a bụ 'National Anthem' n'asụsụ bekee. Nwafọ mba Denmak bụ Erikson gbapụrụ bọọlụ mgbe onye ogbu bọọlụ bụ Bakary Gassama nke Gambia gburu opi ya. Na nkeji anọ na isii, ndị Peruu nwetere ohere ịgba bọọlụ n'efu bụ 'free kick' mgbe Farfan gbaturu Dalsgaard. Ndị Denmak nwetere ' free kick' nke ha nkeji iri n'ime asọmpị ahụ ma ha gbafuru ya. Onye Peruu bụ Tapia nwetere akwụkwọ ịdọ aka na ntị nke bụ 'yellow card' maka ịgbatu Sisto nke Denmak. Nime nkeji iri anọ na ise agbakwunyere otu nkeji, Cueva onye mba Peruu tara ohere inye goolu site na penaụti. Nkeji iri anọ na ise agbakwụnyere nkeji abụọ a lara ezumike ọkara nke bụ 'half time' 'Etu m ga-esi kiri asọmpị Naịjirịa na Kroeshia' Trauco gbaturu Poulsen nke Denmak, ma nye ha ohere ị gba 'free kick' na nkeji iri ise na abụọ. N'ime nkeji iri ise na itoolu Poulsen nyere goolu mgba osi n'okpuru onye oche bọọlụ ndị Peru bụ Gallese gbafe bọọlụ. Cueva gbara ezigbo bọọlụ kpụ ọkụ dịka oche bọọlụ bụ ndị Denmak bụ Schmeiche gbochiri bọọlụ ị gafe ya na nkeji iri isii na itoolu. Ndị Peruu gbalịsiri ike ka nyeta ndị Denmak goolu mana Denmak foro ntụtụ taa na ha agaghị ekwe ka nke a mee. N'ikpeazụ Denmak ji ọkpụ otu merie ndị Peruu (Peruu 0 - 1 Denmak)." 45152385,https://www.bbc.com/igbo/45152385,A nwụchiela onyenkuzi na-elere nwaakwụkwọ ule,Ndị uweojii dabatara n'ebe a na-ele ule ma jide Benjamin Manirambona ka ọ na-ele ule dịka ọgbaama gbara ya.,"Ndị uwe ojii nwụchiri Manirambona n'ịga ma kpụrụ ya pụọ Ọ maghị na ndị uweojii yi akwa nkiti juru ụlọakwụkwọ ahụ kemgbe abalị ya na-eche ịnwụchị ya. Oge ọ hụrụ na o nweghị ebe ọ ga-agbaga, onyeisi Butere Technical College kwetara na ihe aghụghọ ahụ mere. Mazị Manirambona kọwara na ya na-enyere onye agha nọ ọrụ na mba Sọmalị dịika otu na ndị agha ọkpa ụdo aka ime ule kọmputa ahụ Ọ kọwara na onye agha ahụ kwere ya nkwa ego ma ọ lọta. Dịka ọ siri kọwa,nwa akwụkwọ nwere mkpa ezigbo akara iji banye mahadum. Benjamin Manirambona (R) Bụ onye mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na ndị uweojii nwụchiri Onye mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Burundi bụ Janvière Ndirahisha sị, "" Ihe niile ị na-ekwu bụ asị,asị, ya mere anyị kpụ gị apụ."" Ndirahisha kwuru na ọ bụghị mbụ Manirambona na-eme ụdị ihe n'ihi na ha nwetara akụkọ ya nke mere o jiri kpọrọ ndị uwe ojii na ndị ntaakụkọ bịa ije ahụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49793729,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49793729,Presidency 2023: Afọ 2023 ga-egosi ma Igbo ọ ga-apụ na Naịjirịa - Chukwuemeka Ezeife,"Onye bụbụ Gọvanọ Anambra steeti bụ Ọkwadike, Chukwuemeka Ezeife kwuru na ntuliaka onyeisiala 2013 ga-ekwu ka Igbo a ka ga-anọ na Naịjirịa.","Presidency 2023: A na-akpapụ ndị Igbo na Naịjirịa - Ezeife Na mkparịtụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Monde Ọkwadike ndị Igbo sị na ndị okenye Igbo ga-akwụnyere Ipob ma ha mechecha ihe niile ha kwesiri ime ghara ịnwete ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023. Ọ sị na ""Ọ bụrụ na anyị mechaa ihe niile anyị kwesiri ị me, jikọ onwe anyị ọnụ ga-zọọ ọkwa onyeisiala, ha sị na ha agaghị enye anyị maka na anyị bụ Igbo, mara na anyị agaghịziị abụ Naịjirịa"". O kwukwara na ndị Okenye ndị Igbo na-ekwu na Igbo ga-erite uru na-azụmahịa maka na Naịjiria dị ọtụtụ na ọ bụ ya bụ ihe ji ha ikpebi ịpụ na Naịjriịa. Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Ipob Ọ sị na agbanyeghị na nke bụ uche obi ya, mana ọtụtụ mmadụ na-ekwu ya. Goddy Uwazuruike bụbu onyeisi otu a kpọrọ 'Aka Ikenga' mgbe kwenyekwara n'ihe Ọkwadike kwuru. Uwazuruike sị na ""2023 Igbo ga-akwụsi ike. Ihe ọ masịrị ha mee. Anyi ga-enweteriri ọchịchị a, ọ bụrụ na anyị enweteghị ya, anyị emee ihe Ọkwadike kwuru"". Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị Rochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe" afirika-53538674,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53538674,Ọ bụ agụụ ka ọ bụ ụsa mere nwaanyị dị ime ji achọ nri ndị dị aṅaa?,Ị nụla akụkọ banyere oke ọchịchọ ụfọdụ ụmụnwaanyị na-enwe ma ha dị ime nke gụnyere nri ndị dị aṅaa ahụ ha ga na-achọsị ike nakwa nke ha na-asọ asọ.,"Ụfọdụ ụmụnwaanyị a na-edupucha di ha n'ime abalị ka ha ga zụta maọbụ siere ha ụdị nri ahụ na-agụ ha. Onwereike ọ bụrụ na o metụla gị bụ nwaanyị na-agụ akụkọ a maọbụ na o nwereike ime gị mgbe ị ga-adị ime. Akụkọ sị na ihe kpatara oke ọchịchị maọbụ agụụ a bụ na ahụ nwaanyị ahụ chọrọ ya iji nyere onwe ha nakwa nwa ha bu n'afọ aka. Mana mgbe ụfọdụ ị ga-ahụ na nri a ha na-achọ abụghị nri ga-enyere ha na nwa ha bu n'afọ aka n'iwulite ọnọdụ ahụike ha. Ụdị nri na etu o si agụ ụmụnwaanyị dị ime dị iche dabere na mpaghara ụwa mọabụ mba ha si. Ama ụfọdụ ụmụnwaanyị gbara maka nke a N'akụkọ a, anyị tụlere etu o si metụta ụfọdụ ụmụnwaanyị Naịjirịa mgbe ha dị ime. N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị, ha kọwara ihe mere ha ji enwe agụụ maọbụ na-asọ ụfọdụ nri asọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Chika sị na agụụ ọtụtụ nri agụghị mgbe ọ dị ime kama na ọ kpọrọ ọtụtụ nri asị. Ọ sị na ọ na-agbọkarị agbọ nke mere o ji na-asọ nri ndị dịka anụ, anụ ọkụkọ na nri ndị nwere ose. Ọ sị na o nwere mgbe agụụ ịta abacha gụrụ ya ka a ga-asị ma ọ taghị ya na ọ ga-anwụ, mana o mechara zụta ya ma ritu ya obere ike agwụ ya. Ọ gara n'ihu sị na agụụ ịta azụ (catfish), oporo gụrụ ya nakwa iri ụfọdụ nri onye ọzọ siri. Ọ sị na onwere mgbe ịta azụ gụrụ ya, ya na di ya hapụ ụlọ ị chọ ebe a ga-azụta azụ ma bata n'ime abalị mana o mechaghị taa azụ ahụ n'ihi na ọ kwụsịrị ịgụ ya agụụ. Chika sị na ihe o chere butere oke ọchịchọ ndị a bụ mgbanwe na mmiri ọgwụ ahụ ya bụ 'hormones' na Bekee. N'otu aka ahụ Chimezie bụ nwaanyị ọzọ sị na onweghi agụụ nri ndị na-agbagwoju anya kama na ihe na-agukaarị ya oge ọ dị ime bụ agwa ma na-asọ anụ ọkụkọ asọ. Ọ sị na ọ bụrụ ma o righi agwa na ọ na-adị ya ka ụwa ọgwụla. Na ihe ọ ma na-ebute ya bụkwa mgbanwe nke 'hormone' dị n'ahụ ya. Chioma na nke ya sị na ihe na o nwere mmasị n'ebe nri ọdịnala ndị yoruba nọ n'agbanyeghi na ọ bụ onye Igbo. Nri ndị dịka amala, ofe egwusi ndi Yoruba na 'stew' e ji mmanụ nri sie ma na-afụ ezigbote ose. Nwaada Adline sị na ngwa ngwa ọ dị ime, na ọnụ ya gbara ụka nke mere onweghizi nri na-agụ ya agụụ. N'ihi nke a o righi nri ọtụtụ ụbọchị nke mere e ji buga ya n'ụlọọgwụ, ebe dọkịta sị ya chepụta nri ọbụla o nwereike i rinwu. Ọ sị ihe malitere ịgụ ya bụ ịracha mkpụrụ osisi 'mango' n'agbanyeghi na ọ bụghị oge mkpụrụ osisi ahụ. Etu ụmụnwaanyị dị ime ga-esi chekwaa onwe ha n'oge Covid-19 Nri ndị mechara gụọ ya agụụ bụ mmiri ọkụ anụ ewu bụ nke ọ na-agbọ ma o richaa ya, 'indomie' maọbụ 'spaghetti' na akwa e tinyere ezigbo ose. Ebe ọ na-asọ nri nakwa mmanya ọbụla bu ọtọ bịrị bịrị na shuga. Kedụ ihe onye ọkachamara kwuru maka nke a? Otu onye dọkịta bụ ọkachamara n'ahụike ụmụnwaanyị bụ Joseph Akinde tinyere ọnụ n'okwu a a kpọ n'ọnụ. Ọ sị na ihe nwereike ibute oke ọchịchị na ịsọ nri a n'ebe ụmụnwaanyị dị ime nọ bụ mgbanwe dị na mmiri ahụ ha a na-akpọ 'hormone' na Bekee. ""Nri ha na-asọ bụ nke ahụ ha na-anabataghị n'oge ahụ ebe nke ha na-achọsi ike bụ nke ahụ nabatara"", Akinde kwuru. Ọ si na o cheghi na nri ndi ahụ ha na-achọ nwereike ibutere ha nsogbu n'ahụ, ewepu naonye nwere ọrịa ọzọ dị ya n'ahụ. Dọkịta Akinde sị na di ụmụnwaanyị dị ime na ezinaụlọ ya kwesịrị ịnagide oke ọchịchị ahụ ma buru n'obi na ọ bụ nwa mgbe nta na ọ naghị adịgide. Ụzo e nwereike iji gbanahụ ọnọdụ a Ịtụrụ ime bụ ihe dị mma, Nabata mgbanwe ọbụla so ya n'ụdị nri na-agụ gị agụụ. Otu ụzọ kachasị mma nwaanyị dị ime nwereike iji merie ọnọdụ a bụ site n'iri nri zuruoke a kpọrọ 'balanced meal' n'ụbọchị niile. Rie nri ụtụtụ, megaa ahụ (exercise), gbaa mbọ hụ na i nwere nkwado n'ihe metụtara uche gị (emotional support). Ọ bụrụ na nri ahụ gụsie gị ike, i nwereike pụọ ma gagharịa agagharị, chọrọ ihe ị ga-eji gwuo egwu. Na-ege ntị n'ime onwe gị ka ị mara ihe ahụ gị na-achọ ma chọta ihe ọzọ ga-abụ ihe mgbanwe. Ọ bụrụ na ị gaghị edinwu ya, i nwereike ritu nri ahụ nwa obere maka ahụike gị. Mana nke ka nke bụ mee ka onye dọkịta gị mara etu o si eme gị n'ahụ mgbe ọbụla maka ndụmọdụ pụrụiche. Na nchịkọta, mara na ịtụrụ ime bụ ihe dị mma. Nabata mgbanwe ọbụla so ya n'ụdị nri na-agụ gị agụụ. Mana e kwela ka ọ bụrụ ihe ga-emegide maọbụ tinye ahụike na nsogbu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48502896,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48502896,Senegal vs Nigeria: Ụmụ ụdụm Senegal agbajiela Flying Eagles nku,"Agbanyeghị na Flying Eagles ji ikikiri eze bata n'agba nke abụọ asọmpị Iko Mba Ụwa nke akpọrọ ""Fifa Under 20 World Cup"" a na-agba na mba Poland, ndị ha zutere bụ Senegal ekweghi ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko.","Naịjirịa ka jide bọọlụ n'agba nke abụọ asọmpị a mana ọ bụ Senegal bu ụzọ dọka neetị mgbe Sanga nyere goolu na nkeji iri atọ na isii. Na nkeji iri anọ na anọ eche na Naịjirịa nwetere penarịtị mana igwe nchọpụta VAR sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Naịjirịa nwetere nke Bekee kpọrọ ""free kick"". Ka a kana-ekwu nke mere, ọzọ mekwa na nkeji atọ etinyere agba nke mbụ, Alpa Dioundou hụrụ ụzọ n'aka ekpe were gbanyere Niane boolu oji retere Senegal goolu nke abụọ. Eji goolu abụo ahụ mechi agba nke mbụ ahụ. Na nkeji iri ise n'agba nke abụọ Okon ji ngụ kụnye bọọlụ Success Makanjuola gbara jiri nye Naịjirịa goolu nkote ụme. Ọbụzị Senbegal abụọ, Naịjirịa otu. Naịjirịa ka jide bọọlụ na-agba nke a, mana ha ahụghị ụkwụ ha ga-eji nye goolu. Ka asọmpị a na-abị a na njedebe, Senegal kwadoro ịnye goolu abụọ ọzọ mana Oremade, ony enche goolu Naịjirịa nwara kụpụ ha. Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụzị ụla chere Naịjirịa na asọmpị nke afọ a." egwuregwu-43412984,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43412984,Messi enyela goolu otu narị iji gbapụ Chelsea,Lionel Messi nyere ọkpụ goolu abụọ ma nyere Ousmane Dembele aka inye otu ka Barcelona gbakasịrị Chelsea ahụ we merie ha 3:0 iji ruo agba nke anọ nke Champions League nke afọ a.,"Messi dị ọkụ ka Barcelona gara ihu na Champions League Na ngụkọ egwuregwu abụọ ha gbara, Barcelona jiri 4:1 merie Chelsea. Messi nyere goolu nke mbụ n'ime nkeji abụọ egwuregwu ha ji bido, nke mere ka ọ bụrụ goolu ọkachasị nye ọsịsọ kamgbe o bidoro ịgba bọọlụ. Goolu nke abụọ sitere na aka Messi mgbe o kpara ndị nche Chelsea atọ tupu o gbafeere Ousmane Dembele bọọlu ka o ji gbakaa goolu ndị Chelsea. Goolu Dembele bụ nke mbụ ọ na-enye kamgbe o ji bụrụ onye otu Barcelona. Marcos Alonso kụrụ bọọlu na igwe goolu ka Olivier Giroud enweteghị penarity kwesịrị iruru ya mgbe Gerard Pique gbaturu ya tupu Messi eji goolu ya nke 100 mechie okwu. Onye nchịkọta Chelsea bụ Antonio Conte sị na ndị nke ya kwesịrị ịgba ọfụma mana ha ebidoghị ọfụma na Nou Camp. Nke a ga-eme ya ugboro 11 n'usoro ndị Barcelona ga-eru n'asọmpi Champions League, ebe Chelsea na-agba mbọ inweta mmeri ga-enyere ha aka ịgaru Champions League n'afọ na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43182736,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43182736,"Ihe a gbatara na Premier League: Liverpool meriri, Swansea dara","Liverpool jidesiri aka ike n'inweta ohere ịgba Champions League site na mmeri ha meriri ndị West Ham, ebe e meriri ndị West Brom ọzọ nke kpalitere okwu ọpụpụ ha na Premier League.","Mohamed Salah ji ọkpụ 23 bụrụ otu n'ime mmadụ abụọ kacha nye goolu na Premier League Liverpool gbara ndị West Ham 4-1 na be ha n'Anfield nke mere ka ha gbagoo n'ọkwa nke abụọ, jiri pọintị ise na-aga Tottenham bụ ndị nọ n'ọkwa nke ise, ndị ga-asọmpi nke ha echi. Ndị Huddersfield ji 2-1 merie West Brom, nke mere na ọ bụ nanị otu mmeri ka ha nwetarala n'ime asọmpi 14 ha gbarala kamgbe Alan Pardew ji bụrụ onye nchịkọta ha. N'aka ọzọ, Swansea agaghachịla n'ebe ndị nwere ike isi na Premier League pụọ ka ndị Brighton merichara ha. Emerighị ndị Swansea n'ime asọmpi ise ha gbaburu ka ha nọ n'okpuru nchịkọta Carlos Carvalhal, mana eji 4-1 merie ha n'ọgbọ egwuregwu Amex. Ha nọ n'ọkwa 18 ebe ọ bụ okpụ ole ha nwere bụ ihe mere ka Southampton na Crystal Palace kara ha, ebe ọ bụ nanị pọintị asaa na-azọ West Brom ndụ. N'akụkọ ọzọ, goolu Jack Butland bụ onye na-echere ndị Stoke City bọọlụ ji aka ya nye onwe ya mere ka ha na ndị Leicester City gbaa nhata nha 1-1. Otu pọintị ahụ ha nwetara pụtara na Stoke City ka ga-anọ n'ọkwa 19 ha nọbu. Southampton si n'ọkwa atọ ikpeazụ rịpụta ka ha na ndị Burnley bụ ndị n'emeribeghị otu mkpụrụ asọmpi n'afọ 2018, gbara nhata nha 1-1. Bournemouth n'onwe ha si na mmeri lọghachịta bịa saa goolu abụọ Newcastle gbara ha na be ha, mere ka asọmpi ha gwụ na nhata nha 2-2." afirika-52452644,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52452644,Coronavirus: Etu iwu ọhụrụ Buhari tinyere maka covid-19 ga-esi metụta steeti gị,"N'abalị Mọnde bụ ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Epreelu, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputara usoro ọhụrụ a ga-eji buso coronavirus agha.","Ọtụtu ndị na-arụta ihe ha na-eri n'ụbọchị ahụghịzị ohere ịkpata ego maka mmachị ngagharị N'okwu ya, Buhari sị na a ga-amalite ibelata mmachị ngagharị etinyere na Legọs, Ogun nakwa Abuja malite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee. Ọ kọwara na ya na ndị gọvanọ nwere mkpebi a mgbe ha lechara anya etu ""ọnọdụ nọrọ n'ụlọ"" siri metụta akụnaụba obodo, ahịa ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ nakwa ịkọ ihe. N'ozi a ọ gbasara, o kwuru na a ga-amalite mbelata Lockdown ma jirikwa ohere ahụ wụlite nnyocha ọrịa Coronavirus na nchọpụta ndị bu ya. Ọ nọkwa n'otu aka ahụ tinye mmachị ngagharị kpam kpam na Kano ma manye mmachị ngagharị n'abalị na Naịjirịa niile. Ọzọkwa bụ ịsị na mmadụ agaghị apụta n'ezi ma ya bụrụ na okpughi mkpuchi imi. N'okwu Buhari, aihe atọ kacha pụta ihe bụ: Ihe ndị mmadụ kwesiri ịma bụ na a gụpụ Legọs, Abuja, Ogun na Kano, onweghị steeti ebe ọzọ Buhari tinyere mmachị ngaghari. Ya bụ na mmachi ngaghari nke dị na ọtụtụ steeti sitere n'aka ndị gọvanọ na-achi steeti ndị ahụ. Ọ gịnị bụ atụmatụ ""curfew"" a Buhari manyere? ""Curfew"" bụ ọnọdụ mmachi ngagharị kpam kpam gọọmenti na-etinyekarị ma ya bụrụ na enwere ebe nsogbu dị. Nke a Buahri tinyere na-ebido n'elekere asatọ nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ. Ọ bụ ndị uweojii na-echekwa ọnọdụ ""curfew"" Mana ọbụghi ugbua bụ mbụ a na-anụ maka ""curfew"" kemgbe agha coronavirus a malitere. Na steeti Imo, Abia, Kaduna na Ebonyi e nwere atụmatụ a. Kedụ steeti ndị ""Curfew"" a ga-emetụta? Iwu ""Curfew"" a ga-amalite taa bụ Tuzde na steeti niile dị na Naịjirịa. Ihe ndị gọọmentị na uweojii ọwụwa anyanwụ na-ekwu gbasara ya bụ iwu Curfew Abia: Kọmịshọna mgbasa ozi nke Abia steeti gwara BBC na Abia steeti nwere Curfew nke ya bidoro n'elekere isii nke mgbede rue elekere isii nke ụtụtu. Mana o kwuru na ha ga-elebanye anya na ntuziaka onyeisiala nyere ma kwuputazie ihe ọhụrụ ọbụla ha chọrọ ịkwu n'ụbọchị Satọde na-abịa. Imo: Ọnụ na-ekwuru aka na-achị Imo steeti bụ Oguiwike Nwachukwu kwuru na Imo steeti nwekwara Curfew nke ha si elekere isii rue elekere isii dịka nke Abia steeti. Owere, isi obodo Imo steeti Mana o kwuru na ha agaghị agbanwe ihe ọbụla n'ihi na nke ha bu ụzọ buru iwu tupu onyeisiala amanye nke ọhụrụ a. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo bụ Godson Ikeoku kwukwara na ha zuru ka-emee n'idebe iwu ahụ. Enugwu: Kọmịshọna mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Aroh kwuru na ọnọdụ nọrọ n'ụlọ nke amanyere na steeti ahụ ka na-aga n'ihu. Gọvanọ Enugwu tinyere ""lockdown"" nke ya ma ya enweghi ""curfew"" kwukwara na dịka onyeisiala si kwuo na a ga-elebanye ya bụ okwu anya ọfụma tupu ha ekpebie ihe ga-ebe n'oge adịghị anya. Anambra: BBC enwetebeghi kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed kọwara na ha bụ ndị uweojii na-echekwa Anambra ọfụma. Maka akụkọ ndị na-enye ndị uweojii aka azụ abata obodo, o kwuru na ndị uweojii na-arụ ọrụ ha n'ịchọpụta ọrụ mmadụ na-arụ tupu ha ekwe ha banye steeti ahụ. Gọọmentị Anambara eweputala mmachi ngaghari ha tinyere O kwukwara na ha na-achụghachi ụfọdụ mmadụ ejidere n'abụghị ndị ọrụ dị mkpa maọbụ anapụ ha ụgbọala ha. Ebonyi: Ọnụ na-ewkuchitere ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah kwuru na steeti ahụ enweela Curfew nke ya kemgbe gọvanọ Dave Umahi manyere ya. kwuru na Curfew ahụ bidoro n'elekere asaa nke mgbede rue elekere asaa nke ụtụtụ enyela aka ịbelata ohi na ihe ndị ọzọ na-enye ndị mmadụ nsogbu. ""Curfew"" dị na Ebonyi N'ọnụ ya,""Obi adịghị kọmịshọna ndị uweojii mma n'ihi akụkọ na ụfọdụ ndị uweojii na-anara aka azụ iji nabata ndị njem si steeti ndị ọzọ"" Ya mere na agbanweela ndị uweojii na-anọ n'oke Ebonyi steeti na steeti ndị ọzọ iji hụ na anaghị anara aka azụ iji kwe ka ndị mmadụ bata steeti ahụ ọzọ. Kemgbe Naịjirịa nwetara ọnụọgụgụ mbụ ya bụ ọrịa Coronavirus n'ọnwa Febụwarị, ọrịa ahụ efesala mmadụ otu puku na narị atọ na iri atọ na asaa. Ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na ise agbakeela ebe mmadụ iri anọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa." afirika-50584003,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50584003,Unai Emery na Arsenal agbaala alụkwaghịm,Arsenal achụọla onye nchịkọta ha bụ Unai Emery sị ya kwakọrọ pụọ maka na ọ naghị eme nke ọma.,"Arsenal ji ọnụọgụgụ 19 nọdụ n'azụ ndị na-achị ọgbọ Premier League bụ Liverpool Onye kwuru nke a bụ Stan Kroenke so n'otu n'ime ndị nwe Arsenal n'ime ozi o wepụtara n'ehihie taa. Ha sị na Freddie Ljunberg ga-anọchitụ anya nwa mgbe nta ruo mgbe ha ga-enwete onye ọzọ dịka onye nchịkọta n'uju. Unai Emery bụbu onye nchịkọta Paris St-Germain na Sevilla maburu ọkwa ịchịkọta Arsenal n'ọnwa Mee afọ 2018. Ọnọdụ Arsenal na Manchester United bụzị agba ekpere chi Igbo sị 'ma agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ', nke a bụ ọnọdụ Arsenal na Man. United n'asọmpi Europa. Dịke Ịngland abụọ a gbara nkịtị ka 'ụmụaka' abụọ dịka Eintracht Frankfurt na Astana gbaa ha ukwu n'ala ụnyaahụ. N'agbanyeghi na Arsenal nọ n'ụlọ ha 'ọgbọegwuregwu Emirates' ma buru ụzọ nye ndị Frankfurt goolu na nkeji 45 site n'aka Pierre-Emerick Aubameyang. Ha nọkwa ebe ahụ na-ele anya mgbe Frankfurt si n'azụ saa goolu ahụ ma nyekwa goolu ọzọ bụ nke ha ji merie Arsenal. Goolu abụọ ndị Eintracht Frankfurt ji merie Arsenal si n'aka Daichi Kamada n'ime nke 55 na 64 n'ụsoro. N'aka nke ọzọ Manchester United bụ ndị Astana lere ọbịa, bu ụzọ nye Astana goolu site n'aka Jesse Lingard na nkeji 10. Mana Dmitriy Shomko nke Astana siri ọnwụ ma saa goolu ahụ Manchester United nyere na nkeji 55. Site mgbe ahụ gawazie Astana kwanyere Man. United ọkụ n'ike nke mere Di'Shon Bernard onye Man. United ji nye onwe ha goolu na nkeji 62. Nke a mere Astana ji were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United na ngwụcha asọmpi a. Mmeri a e meriri Arsenal na Manchester United e meela ka ọnọdụ ndị nchịkọta ha bụ Unai Emry na Ole Gunnar Solskjaer bụrụ 'A gbaa e kperechi'. Ndị uweojii gara n'ụlọ agadi nwaanyị wee hụ ozu di ya n'ime 'freezer' Ndị uweojii gara ịza oku na be otu nwaanyị dị afọ 75 hụru na ọnwụọla mana nke tụrụ ha n'anya bụ na ha hụrụ ozu di ya n'ime ntụ oyi. Ndị uweojii sị na ha na-eche na aka mmadu adịghị n'ọnwụ nwaanyị ahụ aha ya bụ Jeanne Souron-Mathers di afọ 75. Ha sị na a hụru ya bụ nwaanyị ebe edina n'ala n'ọnwụ, mana ọ bụ ozu di ya ka ha che na ọkwụghi ọtọ makana o nọọla n'ime ntụ oyi ahụ afọ. Onye uweojii aha ya bụ Jeremy Hansen na mpaghara ""Salt Lake City"" sị na ya bụ ihe na ""esi isi. Agbanyeghi nke a, ndi uweojii si na ha amaghị ma aka nwaanyi ahụ ọ dị n'ọnwụ di ya. Ndị ọgbataobi ha sị na otela ha hụrụ nwoke ahụ. Ụfọdụ sị otu afọ ebe ndị ọzọ sị na oruola afọ iri na otu. Burkina Faso: Mba Amerịka sị ka ndị be ha nọ mba a kpọla ụmụ ha Mba Amerịka na-ekwuola na mmadụ niile dị afọ iri abụọ na otu gbadawa na-arụ ọrụ maọbụ na buru nwa onye ọrụ na ụlọ mmekọ ha na Burkina Faso kwakọrọ lawa. Nke a na-abịa dịka ha sị na ọnọdụ nchekwa na mba ahụ. N'ime akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara,ndị na-anọchịte anya Amerịka na Burkina Faso sị agbanyeghi na onweghi ihe ha nwereike rụtụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe a ha kwuru, ọnọdụ nchekwa na ya bụ mba eruola ebe ọ gaghi amasị ụmụaka ịnọ n'ụlọ ọrụ ha. Ndị ọrụ ndi ọzọ ka ga-anọ. Nke a na-abịa dịka mba Amerịka wepụtara ndụmọdụ o nyere ndị be ha, nke sị ha gbanri ịga mba Burkina Faso maka mkpa mkpa ndi oyi ndu egwu na-akpa na ya bụ mba. Ndi oyi ndu egwu na-enyue ezigbote nsogbu na mba ahụ nke gunyere ị na-agagharị na-achọ ndị ha ga-awakpo." afirika-43750157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750157,O nwere uru dị n'iwete ego Abacha 'zuru' n'aka Naịjirịa?,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwenyela na onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Sanị Abacha, zuru ọtụtụ ego.","Buhari ka na-ekwe nkwa na ọchịchị ya na-ebuso mpu na aghọghọ agha BBC Igbo na-achọ ị chọpụta ihe ihe ego Abacha 'zuru' ga-emenwuru Naịjirịa. Mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba kwuru na nde dọla narị atọ na iri abụọ na abụọ ($322) ka ndị mba switzerland nyeghachịrị Naịjirịa. Ha kwuru na akuola ego a n'ụlọọrụ ego Central Bank n'ụbọchị iri na asatọ n'ime ọnwa Dizemba afọ 2017. Cheta n'afọ 2003, gọọmentị kwuru na a hụrụ ego Abacha zuru ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m) Abacha chịrị Naịjirịa na-etiti afọ 1993 ruo 1998 N'afọ 2002, gọọmentị ala Switzerland kwuru na ha enyechietala gọọmentị Naịjirịa ego Abacha zuru ru nde dọla narị asa ($700m). N'afọ 1998, Buhari kwuru na Naịjirịa kwesiri ị na-ekele Abacha makana o bulitere akụnaụba ala Naịjirịa. Ha, na ndị ọzọ chịrị Naịjirịa dịka Ibrahim Babangida na Abdulsalami Abubakar kwuru ihe a, na ngwụcha otu izuuka Abacha nwụrụ. Akụkọ ka -na-abịa Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 45071282,https://www.bbc.com/igbo/45071282,Anyị nwere ikike ịkpụpụ ndị omeiwu hapụrụ APC ụlọikpe - Lai Mohammed,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Gọọmenti etiti etinyela ọnụ na ndị hapụrụ pati APC. Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Anyị na-ebido na gọọmenti etiti bụ ndị kwuru na ha nwere ikike ndị omeiwu pụrụ na pati APC ụlọikpe ma mkpa ya dị. Lai Mohammed kwuru nke a taa ka ndị ntaakụkọ jụrụ ya ihe ha ga-eme gbasara ndị omeiwu ahụ gbara ha alụkwaghị m. Naịjirịa Ndị ụlọọrụ kọstọm chọrọ ịchụ mpụ na ahịa iwu ọsọ. Ụlọọrụ na-ahụ maka mbubata ihe na Naịjirịa na ibupu bụ Kọstọm na Bekee emeela nchịgharị ime ụlọ. Ha wegharịrị ndị ọrụ ha mmadụ iri asaa maka iluso ahịa iwu na mpụ ọgụ na ngalaba ahụ. Akụkọ mba ofesi Otu mbaụwa United Nations ekwuola na mmadụ otu puku na narị ise ndị mbịara mbịara nwụrụ ebe ha na-achọ ife mmiri Mediterranean. Gọọmenti naịjirịa kpọlatara ọtụtụ ndị Naịjịrịa a na-ata ahụhụ na Libya n'ọnwa Jenuwarị N'ọnwa Juunu na Julai, mmadụ nari asatọ n'ise nwụrụ nke mere mmiri Mediterranean ji bụrụ mmiri kachasị egwu na mbaụwa. N'egwuregwu, N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Indomitable Lions nke Kameruun enwetaal onye nkuzi ọhụrụ. Clarence Seedorf rụrụ ọrụ ka onye nkuzi na AC Milan, Shenzen nke China na Deportivo La Coruna Ọ bụ Clarence Seedorf na Patrick Kluivert ga-abụ onye nkuzi na osote ga-akwado ha maka asọmpi Afcon 2019. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ" mba-uba-50515750,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-50515750,Allen Onyema sị na onweghi nrụrụaka ọbụla o mere n'Amerịka maọbụ ebe ọbụla,Onyeisi ụlọọrụ Air Peace bụ Allen Onyema agọọlas ụkwụ na aka maka ebubo nrụrụaka mba Amerịka na-ebo ya.,"N'ozi Air Peace tinyere n'akara Twitter ha, ha sị na ọ bu ego Maazị Onyema ka o jiri gote ụgbọelu na-akụrụmgwa ya. ""Onweghi ego ọbụla o butere n'aka ụlọakụ maọbụ mmadụ. Nke mere na onweghi ụlọakụ na mba ofesi na chọ ego ha maka nke a."" End of Twitter post, 1 Nke so akụkọ pụtara n'ọba internet ụlọọrụ gbasara ikpe nke mba Amerịka n'obodo Atlanta, na-akọwa na ha na-ebo Allen Onyema bụ onyeisi Air Peace ebubo maka nrụrụaka. Na nkọwa ha, Maazi Onyema na onye na-ahụ maka ego na nhazi n'ụlọọrụ Air Peace bụ Ejiroghene Eghagha, nwere azịza maka nrụrụaka. Ebe ebubo ha wụkwasara Onyema metụtara ihe Bekee kpọrọ ""Money Laundering"", nke Maazị Eghagha metutara igwu ulọakụ chandum na izu aha mmadụ. Dịka ozi si ngalaba na-ahụ maka ikpe nke obodo Atlanta siri kwuo, Ọkaiwu Amerịka aha ya bụ Byung J Pak, sị na Onyema ji aha na ọ bụ ojiegoachụego ama ama mee nrụrụaka. Pak sị; ""Anyị ga-agba mbọ hụ na anyị gbochiri ohere ndị mmadị ga-eji chọọ ịghọrị ụlọakụ anyị, ọ sọkwa ya bụrụ na ndị chọrọ ime ihe yi uwe ka ndị ojiegoachụego nke mbaụwa."" Mgbe Onyema kpere udo n'etiti ndí Fulani na-achi ehi na ndí Benue steeti Onye ọzọ okwu ya pụtara n'ọba ịntanetị ahụ bụ Thomas J. Holloman, bụ onye na-enyocha mpụ banyere ụtụisi n'Amerịka, sị, ""Dịka etu ụlọakụ anyị siri dị mkpa maka mbughari ego na mbaụwa niile, ndị na-achọ iji aghụghọ mee nrụrụaka site na inye akwụkwọ adịgboroja, kwesịrị ịma na anyị ga-anwụchị ha makana ndị ọrụ anyị na-arụkọ ọrụ."" Otu ebubo ha boro Onyema bụ na o nwere ọtụtụ akụnaụba dị ka ha eziri ezi na Mba Amerịka mana ha bụ ụzo o si eme ihe a ha kpọrọ nrụrụaka. Akwukwọ a metụtakwara ọnụ na ngalaba dị iche iche Allen Onyema hibere iji hazie udo na Naịjirịa dịka ""Foundation for Ethnic Harmony, International Center for Non-Violence na Peace Development, na All-Time Peace Media Communications Limited."" Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka Cheta na Onyema natara ezigbote ekele n'aka ụmụ Naịjirịa maka etu o si gbatara ndị ọgbaghara ịkpa oke agbụrụ mere na mba Saụt Afrịka n'afọ 2019 a metụtara, site n'ịwepụta ụgbọelu ga-ebulata ha. Onyema bụkwa onye na-agba mbọ maka udo Naịjirịa site n'ịkpọkọta ndị nwere ọgbaghara. Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu" afirika-47625267,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47625267,Aba: Di na nwunye gachara agbamakwụkwọ kubie - Uweojii,"Ọ dịkwazi ka chi na-efo n'ụwa, ọ na-efote ihe iribama dị icheiche.","Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, kedụ ihe aga-akpọ akụkọ di na nwunye gara bụrụ onyeisioche agbamakwụkwọ, buru nri enyere ha lawa ma rie ya ka ha narụrụ mana ha si n'ụra fere ọnwụ dịka ndị uweojii si gwa BBC. Ọ nụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na n'ụtụtụ ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Maachi, ka ndị be di na nwunye ahụ biara mee mkpesa. Ha si na kamgbe ha na-akpọ ekwenti di na nwunye ahụ, na onweghị onye na-aza. Ha wee si ka ha gaa n'ụlọ ha. O kwuru na ha kụgidere aka mana onweghị onye zara ha, ha wee were mbube riwa ulọ ha site na gbamgbam ụlọ ahụ. Geoffrey kwuru na ha gwara ya na ndị otu ya na mgbe ha ribara, na ha hụrụ ozu ha abụọ na nwannne nke nwaanyi ka ha tọgbọrọ n'ala. Nke a mere ka ha bia mee nkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii ma kpọrọkwa nwanne nke nwaanyị so ha gawa ụlọọgwụ n'ihi na ọ ka na-eku ume. Ogbonna kwuru na ya na ndị otu ya ka na-eche ka nwata nwaanyị ahụ nwetecha onwe ya ka o were gwa ha ihe ọ ma maka ya bụ ihe mberede. O kwukwara na ha na-elekwa anya nyocha ga-esi n'aka dọkịta pụta gbasara ihe gburu di na nwunye ahụ, mana ugbua ahụ ha abanyela ụlọozu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44143554,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44143554,"Gini mere Germany ji chọọ ịkpọghachị ndị Naịjirịa 30,000","Mba Germany na-akwado ịkpọghachite umu Naịjirịa 30,000 na-enweghị akwụkwo nyere ha ikike ịnọ na obodo ahụ.","Ndi Naịjirịa gbara ọsọndụ karịrị na Europe Onye na-ahu maka ihe gbasara mba ofesi na gọọmentị Naịjirịa bụ Geoffrey Onyeama kwuru nkea mgbe ya na onye ndụmọdụ onyesiala mba Germany bụ Jan Hecker zukọrọ n'Abuja. Onyeama na-akọwa na onwere nhazi ndị Germany na-eme nke ga-eme ka ahazie ndị a ga-akpọlata ngangwa. Onyeama kọwara n'ime afọ abụọ gara aga umu Naịjirịa 30,000 kwesiri ịlọta, mana ọ bu sọsọ 200 ka a kpọlatala. Ka nke a na-eme, BBC Igbo gara otu nwaafọ NaịjiRịa bi na Germany akpọrọ Obinna Chinweokwu ajụjụ maka ihe ọhụrụ na mba ahụ. Maazị Chinweokwu gwara anyị na ya na-agụ akwụkwọ na Mahadụm na Germany, ebe ọ na-achọ ị nweta akwụkwọ ọkachamara nke akpọrọ PHD na asụsu Bekee. Ọ sị na ọ bụ ndị si ụzọ mmịri bata Germany ka ihe a kachasi metụta. Gere ya ndị ebe a: Obinna Chinweokwu gwara anyị maka ndi no Germany Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 48096873,https://www.bbc.com/igbo/48096873,Rochas Okorocha : E meela ngaghariwe maka atụmatụ ibupụ Imo State Polytechnic,"Agụmakwụkwọ akwụsịtula n'ụlọakwụkwọ dị elu bụ ImoState Polytechnic dị n'Ụmụagwo, nke dị n'Okpuru ọchịchị Ohaji/Egbema.",Nke a bịara dịka ndị obodo ahụ mechara ngagharịiwe na gburugburu ụlọakwụkwọ ahụ n'ụbọchị Monde iji gosipụta iwe gbasara atụmatụ gọọmenti Imo ibupu ụlọakwụkwọ ahụ ebe ọ dị. Ndị na-eme ngagharịiwe gbochiri ebe e si abanye n'ime ụlọakwụkwọ ahụ gbochie ụmụakwụkwọ nakwa ndị ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ ịpụ maọbụ bata. Cheta na gọọmenti steeti ahụ mere politeknik ahụ mahadum aha ya bụzị University of Agriculture and Environmental Sciences. Ha natakwara nkwado nke ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka mahadum bụ National University Commission. Gọọmenti steeti gara n'ihu buga mahadum n'ọnọdụ ọhụrụ n'Okpuru ọchịchị Ehime Mbanọ. Gọọmenti chọrọ ime ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ bụrụzie Imo State University of Agriculture and Environmental Sciences. Mana ụfọdụ ndị mmadụ ekwenyeghị na nke a nke mere na ha malịtere ịme ngagharịiwe n'ụbọchị Monde. afirika-51018108,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018108,Porn sites: Enugu na steeti ndị ọzọ kachasị chọọ ihe 'nkiri 'gay' na 'Lesbian',"Enugu, Imo na Anambra so na steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri ""Gay"" nakwa ""Lesbian"" n'afọ 2019 dịka ""Google search trends"" nke 2019 si gosipụta.","Ebe Bayelsa, Enugu nakwa Edo so na steeti ndị mbụ kachasị chọọ ihe gbasara mmekọ nwaanyị n'afọ 2019 na Naịjirịa. Lee tebụlụ ya ebe a na ogo pasenti ya. Steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri 'gay' (Source: Google Search Trends 2019) Naịjirịa bu ụzọ n'obodo kacha achọ ụmụ nwaanyị buru ibu gba ọtọ - 'PornHub Insights' Naịjirịa bụ obodo e ji oke ikpere chukwu mara mana ọ kana gbagọjụ ndị mmadụ anya etu ha si bute ọzọ na mba kachasị ekiri ụnwaanyị gba ọtọ n'ọbaozi PornHub. Ụlọọrụ Pornhub wepụtara ozi a na webụsaitị ha ka ha na-eme nchịkọta ndị ka wee chọta webụsaitị ha n'afọ 2019. Ha depụtara na Naịjiria bu ụzọ na mba kachasị chọta ụmụwaanyị buru ibu na-agba ọtọ na webụsaiti ha n'ọnwa Maachị n'afọ 2019 , ebe Ghana , Kenya na Egypt na-eso ha n'azụ. PornHub kwukwara na ndị mmadụ agaghị na webụsaitị nnukwu n'oge ezumike. Gịnị kpatara nke a? Ọkammụta Mmirimmasinachi Ekechukwu na-ahụ ihe gbasara maka mmekọrịta ahụ kwuru na ụmụ Naịjirịa na-emekarị mara mara n'ihu gwọmpọtị n'azụ. O kwuru na o nweghị ihe mmapụ obi dị na ya makana nwoke maọbụ nwaanyi nwere ebumnuche ha nwere wee na-aga na ya bụ webụsaitị. Mana agwa ndị nsọ ụmụ Naịjirịa meziri ka ọ dịka nchọpụta ọ bụ arụ. Gbasara akụkọ kwuru na ụmụ nwaanyị kachọ mmekọrịta nwaanyị na nwaanyị ibe ha na webụsaiti ahụ, Ekechukwu kwuru ihe a riri ya ọnụ. Mana o kwuru na o nwereike ị bụ obi mgbawa ụmụnwoke na-enye ha butere nke a. Ọ rịọrịọ ka ụmụ Naịjirịa kwụsị mara mara n'ihu gwọmpọti n'azụ. Akụkọ ga-amasị gị Buhari: Ihe ndị Igbo chọrọ n'aka ya n'afọ 2020" 43089488,https://www.bbc.com/igbo/43089488,Jacob Zuma: Gọvanọ Okorocha ajụla ikutu akpụrụakpụ ya,"N'agbanyeghị na Jacob Zuma arituola n'oche ọchịchị mba South Africa, gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola sị na ya agahị akutu akpụrụakpụ ya.","Rochas gụkwara otu okporoụzọ dị n'Owerri aha Zuma Ka ụbọchị abụọ gachara kemgbe Zuma si n'ọche ọchịchị rituo, ndị mmadụ bidoro ijụ ajụjụ ma Okorocha ọ ga-enye iwu ka akutuo akpụrụakpụ ya ọ kpụrụ n'afọ 2017. Ndị mba South Africa na ndị otu pati Zuma bụ ANC gwara ya rituo maka ebubo mpụ na nrụrụaka eboro ya. Ebubo a kpatara ụfọdụ ndị mmadụ ji cheta akpụrụakpụ a ma kwulite okwu ikutu ya. Onye na-ekwuchitere Okorocha bụ Sam Onwuemeodo wepụtara akwụkwọ gọvanọ binyere, ebe ọ sị na agahị akutu akpụrakpụ Zuma. Ọ sị ""gbasara akpụrụakpụ Jacob Zuma n'Owerri na iritu n'ọchịchị ya dịka onyeisiala mba South Africa ụbọchị ole gara aga, agaghị akutu akpụrụakpụ a. Akpụrụ ya oge ọ ka bụ onyeisiala. Ka anyị tinye uchu n'akụkọ gbasara ndụ ya. N'ịma atụ, otu nwoke na-agaghị akwụkwọ n'ụzọ ọbụla ma mechaa bụrụ onye aka ya dị na nwereonwe ndị obodo ya ma bụrụkwa onyeisiala otu n'ime mba na-edu mba Afịrịka ndị ọzọ, bụ ihe kwesịrị ime ka ndị mmadụ cheba echiche."" Ihe a Rochas kwuru ozuru iji ahapụ akpụrụakpụ Zuma ka ọ kwụrụ n'Imo steeti?" afirika-46300213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46300213,Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu,"N'ọba ozi Twitter ha, otu pati PDP ekwuola na ndị Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa apụghị ịtụnyere Onyeisiala Muhammadụ Buharị akwụkwọ na ntụlịaka 2019.","Joe Igbokwe na Nnia Nwodo PDP kwụrụ n'ihe ha jiri kwesie ike na nke a bụ maka na ọnweghị nkwa niile PDP kwere ndị Igbo ha mejuputara. Ha sị na obi malitere ịmapụ onyeisiala Muhammadu Buhari kemgbe ndị ọwụwa anyanwụ natabatachara onye bu ọkọrotọ PDP na ndọrọdọrọ ọchịchị 2019 bụ Atiku Abubakar n'uju maka ọrụ ọma, ugwu na nyekwa Okeke na Okafo oke ruru ha. PDP kwuru na mbọ niile Muhammadu Buhari na-agba ihụ na ndị ọwụwa anyanwụ kwadoro ya nara n'iyi maka na ha ahụla na ọ bụ okwe nkwa eme eme. End of Twitter post, 1 N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere APC na Legọs steeti bụ Joe Igbokwe ekwuola na Igbo anabataghị APC bụ ezigbo asị. Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu Ọ sị na njem nleta ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ gara na nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nsonso a gosiri ezi nnabata. Ọ gbarụkwara ihu kwuo na ""Ohaneze Ndigbo bụ ndị ọ sị nabatara PDP naara ego iji mee nke a"". Ọ sị na ihere n'eme ya maka na ndị Igbo amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọbụrụ na Igbo bijọọ aka na ntuliaka a na-abịa n'ihere ga-eme ha. BBC kpọtụkwara Onye ndu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ị nụrụ onu ya maka ebubo a Joe Igbokwe boro ya. Nnia Nwodo zara na Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu. Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu ""Nke mbụ. Ohaneze ọ nabatara Atiku? Ọ bụ ndị ọnụ na-eru na-okwu n'Igbo nke onye ndụ ha bụ Ben Nwabuze kpọrọ m oku mgbe Atiku bịara. Ọ bụghị Ohaneze kpọrọ ya bụ ọgbakọ. Ọ bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019 ka Ohaneze ga-ezukọ ịkwụ onye anyị ga-akwado na ntụlịaka 2019."" Osị na obi ndị ndị Igbo ụtụ na-ewepụtara onye igbo na ọnọdụ enwepụtara Peter Obi. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48689366,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48689366,World Sickle Cell Day: Onye na-arịa 'Sickle Cell' ga-enwete uru na nri ndị a,"Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko nke bụ 'Sickle Cell' na Bekee, ndị ọkachamara na nri na ihe ọ na-enye n'ahụ enyela ndụmọdụ ọhụrụ","Florence Ngozi Uchendu kwuru na o nwere ụfọdụ nri ndị na-arịa ọrịa a kwesiri ị na-eri iji chekwa onwe ha ọfụma karịa ndị enweghi ọrịa a. O kwuru na nri ndị na-enye ike dịka akpụ, ji, osikapa na ndị ọzọ dị mma iji nye ha ike n'ihi na ọrịa a na-agwụ ike. O kwukwara na akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi dị icheiche na nye aka ịnye ha ihe ndị na-edozi ahụ. Ọ kwuru na ọ bụ maka na ndị na-arịa ọrịa anaghị enweta ihe dịkia Ayọn, vitamins, kalshiụm wdg. Ụgụ bụ akwụkwọ nri ndị ọrịa ọbara nko kwesiri ị na-eri Nri ọzọ ọ kpọrọ aha bụ mmiri ala ehi nke ga-enye ha kalshiụm n'ahụ nakwa mmiri ọṅụṅụ nke ga-akwụsị ahụ mgbu. Dịbia bekee ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ McGinger Ibeneme kwuru na ezigbo nri zuruoke nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ịdọtị ndụ ndị na-arịa ọrịa ọbara. O kwuru na ndị na-arịa ụdịrị ọrịa na-enwe ọtụtụ nsogbu gụnyere ọkpụkpụ mgbu, obi mgbu, ịrịa ahụ mgbe ọbụla. Ụtazị so n'akwụkwọ nri ndị ọrịa ọbara nko ga na-eri Kedụ ihe ị ga-eme ka ịnwe ogologo ndụ n'ọrịa a? Macginger kpọpụtara ihe ndị ha ga-eme iwe bie ogologo ndụ: Ọ sị ka ha ahọrọla nri ọbụla. Maka na ọ bụ na nri ka ha ga-enye ihe n'ahụ. O nwere ụzọ esi egbochi ọrịa a? Mcginger kwuru na ọ bụ naani site n'inyocha iji wee chọpụta ma onye gị na ya na-alụkọ dị na nwunye ,ma ọbara ụnụ agakọrọ nkeọma. Nke a gunyere :AS na AS agaghị alụli, mana AS na AA ga-alụli. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ọrịa a @Taswalu na-arịọ ndị mmadụ ka ha nyocha onwe ha tupu ha lụọ. @toksy_bee_ chọrọ ka ekpere ya ekpere ya makana ya bụ ọrịa ji ya na njọ. @EkeminiMacauley kwuru na ya na-akwado ndị na-arịa ọrịa a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53758354,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53758354,"Oluomachi, Mmesoma, Rikisat blue eyes na ndị ọzọ i nyerela aka ịza mmadụ na-amaghị","Ndị Igbo si na ọ bụ aka mere azụ o ji gbakọọ, nke pụtara na ọ bụ mmadụ na-eme mmadụ ibe ya nnukwu mmadụ.","A na-ekwu na ọ dị mkpa ka mmadụ ghara ichefu onye nyerela ya aka mgbe ọ nọ na mkpa. Ndị dịka Oluchi Onweagba Orlandi, onye ji ahụ ya ere uwe (model), nakwa Kanu Nwankwo bụ ọgba bọọlụ, bụcha ndị nọ ha nso tụpụtara alo ka e nye ha ohere nke mere ha ji tiwaa. Mana ị ma na e nwere ụfọdụ ụmụ naijiria aka gị, eee, gị onwe gị, dị n'ime ha ihe ha bụ taa? Dịka ị na-eke akụkọ ha na-soshal midia, i so na ndị mere ka ụwa mara ha. Ndị soshal midia mere mmadụ: 1. Oluomachi Opara Oluomachi sozi na ndị gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kpọrọ 'nwa m' Akụkọ Oluomachi Opara ka dị ọkụ n'obi ọtụtụ mmadụ ugbua, n'agbanyeghi na ọ malitere naanị ọnwa ole na ole gara aga. Nwata ahụ bụ onye Ahiazu Mbaise, n'Imo steeti, bụ nwata na-ebugharị ahịa n'Owere iji nyere nne na nna ya aka tupu chi nke ya efoo. Ọ bụ ihe onyonyo ebe ọ na-ekwe ukwe wuru ewu dịka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere gị onwe gị kesara onyonyo ebe ọ na-agụ egwu mere ya ka ọ ghọọ ihe ndị nwere agba na-achọ ka akara dị ọkụ. Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, Sinetọ Stella Oduah, nakwa Ụka Katọlik enyela ya ohere ịgụ akwụkwọ n'efu, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nyere ya na ezinaụlọ ya ohere agụmakwụkwọ n'efu. Etu m si mụta ịgụ egwu - Oluomachi Opara 2. Mmesoma Madu Mmesoma Anthony Madu bụ nwata nwoke dị afọ 12 na-eri egwu 'ballet' ka ji. O wuru ewu dịka ihe onyonyo na-egosi ebe ọ na-agba 'ballet' na mmiri ozuzo. Ka ọ dị ugbua, Mmesoma enwetala ohere ịga mba Amerịka gụọ akwụkwọ maka etu e si agba egwu ballet nke ọma. Ballet Dance: Etu nwata ji mkpịsị ụkwụ agba egwu ji gbata aka nchawa 3. Risikat nwere 'blue eyes' Ọtụtụ ndị mmadụ malitere inyere Risikat Azeezat na ụmụ ya aka dịka akụkọ kwuru na di ya chụpụrụ ha n'ihi ụcha anya ha. Na nsonso a ka akụkọ pụtara maka ụmụaka abụọ ""nna ha jụrụ ha na nne ha"" bụ Risikat Azeez n'ihi na anya ha na-acha anụnụ anụnụ (blue). Ya bụ akụkọ kpọtụrụ akpọtụ na soshal midia n'ihi na mụ na gị kpọrọ ibe anyị 'bịa hụrụ ihe m hụrụ.' Na-egbughi oge, enyemaka sitere n'aka nwunye gọvanọ Kwara steeti bịara ha dịka ha nwetara ohere agụmakwụ na nleta pụrụ iche. Ugbua, akụkọ na-ekwu na di nwaanyị ahụ alọghachịla azụ ma rịọ mgbaghara. 4.Ikorodu bois I chetere ụmụaka atọ ahụ na-eme ihe onyonyo ebe ha na-eji ụzọ nke ha ejije ihe nkiri (film) ndị a ma ama na sọshal midia? Ọnwa ole na ole gara aga ka ha ṅomiri ejije ndị Hollywood nke Netflix kwadoro, a kpọrọ ""Extraction"". Nke a mere ka anya ndị na-ewu ewu na mba Amerịka rute ha. Ị ma na nsonso a na ụlọọrụ na-egosi ihe ejije n'ọrụ bụ na Neflix ziteere ha akụrụngwa e ji eme onyonyo iji nyere ọrụ ha aka. Nke a bụ dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekesa aka ọrụ ha aghara agha na socịal midia. Chetakwa na a kpọburu ha oku ime ịbịa ngosiputa (movie premiere) ihe nkiri na mba Amerịka mgbe a ga-ewepụta ""Extraction 2"". 5. Emmanuella Ọ bụ nwata na-emepụta ihe ọchị Onye ọbụla ma ""Mark Angel Comedy"" matara nwaada Igbo a na-ewu ebe nile maka ịkpa ọchị onye oke amamiihe. Ọ bụ oke owuwu ihe onyonyo nke ya na nwanne ya nwoke nwe a na-akpọ Mark Angel Comedy na-ewu, na-eme nwata ahụ ọgaranya, ma mee ya onye ya na ndị ọgaranya na ndị a na-anụ aha ha na-akparịta. 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ' Nwata kwọọ aka, o soro ndị okenye rie nri. Emmanuella anatala nturuugo dị iche iche nke gụnyere ugwu onye bụbu onyeisi ụlọmeiwu ukwu bụ Bukola Saraki nyere ya. Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise, e jikwala ihu ya ree ahịa nke Bekee kpọrọ ""advert"". 6. Eli Waduba Yusuf Eli Waduba Yusuf bụ nwata nwokorobịa ji mkpịsị odee ese ihe osise, mee ya ka ọ dị ka foto. Ọ bụ ka ndị mmadụ kesara eserese Kevin Hart bụ ọkpaọchị mba Amerịka Yusuf sere, ka ụwa ya gbanwere n'otu ntabianya. 7. Ụmụaka 'Dreamcatchers' I nweghị ego dịka Dangote,Cosharis maọbụ Innoson, mana mana i sorola ndị mere ụmụaka @Dreamcatchersdandị a na-anụ aha ha n'ụwa dum. @Dreamcatchersda bụ otu abụghị nke gọọmenti, ndị na-akpọkọba ụmụaka enweghị nne na nna na ndị puru nụzọ ọnụ site ịgba na ịkpụ egwu nakwa ihe nka ndị ọzọ. Ugbua ụmụaka esila na nkerịta a na-eke akụkọ ha na soshal midia nweta ohere ị ga-ala Bekee. Ha na ndị nnukwu mmadụ na-erịkọ n'otu efere. Ọ bụladị oge 'Naomi Campbell' bịara ala Naijiria, ọ gara zute ụmụaka ahụ. 8. Success Adegor Na ofe ezughị nri ma ya fọdụ nke ị ga-edobe maka echi abụghị na o nweghị ndị iji oge na 'data' gị gbanwee ọnọdụ ụbịam na ahụhụ ha nọbu na ya. I chetara nwata ahụ wuru ewu na soshal midia maka na a chụrụ ya n'ụlọakwụkwọ maka na ọ kwụghị ụgwọakwụkwọ ya, ya na-atụ arịrị na-asị ka ọ gara akara ya mma na ha pịrara ya ụtarị, hapụ ya ka ya soro ibe ya? Success Adegor si na nkesa akụkọ ya nke i sonyere wee kesaa na soshal midia nweta ndị gbatara ya ọsọ enyemaka ego, ohere isonye na ihe ejije nakwa ohere agụmakwụkwọ n'efu. Na-agbanyeghị na Success kwuru na nsonso na na ọtụtụ ndị kwere ya na ezinaụlọ ya nkwa e mezughị ya mana nke bụ eziokwu bụ na ọnọdụ ụbịam ha nobu na ya agbanweela. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57130633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57130633,"Roles of family members: Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọ",Ezịnaụlọ ọbụla dị mma dịka ụlọ elu arụrụ nke ọma ka ọ kwụrụ chịm.,"Ụdị ụlọ a na-enwe ezi ntọala siri ike nke ga-eburu ya ruo oge dị anya. Etu a ka ezinaụlọ ọbụla nwere ezi ntọala ga-esi eto nke ọma, nwee udo, ịhụnanya dgz. Gịnị bụ ezinaụlọ? Mazi Chigozie Nnabuihe bụ onye ọkachamara n'asụsụ nakwa omenala Igbo sị na ezinaụlọ bụ mmadụ abụọ maọbụ ọlụlụ, ọmụmụ maọbụ nkọrọ jikọtara ọnụ. Ọ sị na ezinaụlọ gụnyere nne, nna na ụmụ; na mgbe ọbụla nwoke lụrụ nwaanyị na o hiwela ezinaụlọ. Nnabuihe sị na ""Iji mee ka ezinaụlọ nwee ezi ntọala nna, nne na ụmụaka nwere ọrụ ha ga-arụ. ""Maka na aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nrị, ha abụọ adị ọcha."" Kedụ ọrụ nne, nna na ụmụ na-arụ n'ime ezinaụlọ? Mazị Onyekaba Emmanuel Odenigbo e ji 'Eddy Ngene' maara na-eti egwu ọdịnala kọọwara ụfọdụ ọrụ dịịrị onye ọbụla n'ezinaụlọ. Ọrụ nna Ọ sị na nna pụtara ""onye nnagide"" nke bụ na ọ ga-anagide ihe niile site nwunye, ụmụ na ndị agbataobi ya. Ọ bụ nna ka ọ dịịrị ịgbapụ, gbaa mbọ chọta ihe ezinaụlọ ga-eri. Ọ bụkwa ọrụ nwoke inyere nwunye ya aka ebe ike na-adịghị ya dịka mgbe ọ dị ime maọbụ mụọ nwa ọhụrụ. Nna dịka onyeisi ezinaụlọ ọbụla, ọrụ ya bụ ichekwa ezinaụlọ site n'ihe izendụ ọbụla. Otu n'ime ọrụ ọzọ nna na-arụ bụ ikuziri ụmụaka etu e si ebi ndụ gụnyere nkwanye ukwu, ikele ekele na ndị ọzọ. Ọrụ nne Mazị Odenigbo sị na nne pụtara ""onye nnekọta"" ọ bụ onye ga-elekọta di ya dịka nwa ya ma lekọtakwa ụmụ ya. Ọ ga-agba mbọ ịhụ na ezinaụlọ na-adị ọcha, na udo ga-achị n'ime ezinaụlọ. Ọ bụ eziokwu na di bụ isi ezinaụlọ mana nwunye bụ olu ezinaụlọ, isi agaghị eme ihe ọbụla maọbụrụ na olu adịghị ya. Ọ bụ ebe olu tụgharịrị ka isi na-ele anya makana ọ bụ olu na-ebu isi. Nne na-anọ n'etiti mmadụ na mmụọ n'ime ezinaụlọ, ọ bụ nwunye bụ onyeisi ekpere n'ezinaụlọ. Nne ka ọ dịịrị isi nri, ịhazi nakwa ịkpakọta ezinaụlọ ọnụ. Dịka nna, nne na-arụkwa ọrụ ikuziri ụmụaka etu e si ebi ndụ dị mma. Ọrụ ụmụaka Odenigbo sị na ụmụaka pụtara ""ihe mmịta maọbụ uru"" sitere n'owe ihe ubi di na nwunye kụrụ. Ọrụ ụmụaka bụ ilekọta ndị nne na nna taara ahụhụ mụọ ha, zụọ ha ma chekwaa ha ruo mgbe ha tooro. Ọ bụ ọrụ ụmụaaka inye nne na nna nsọpụrụ, nkwanye ugwu, ikele ekele nakwa ndị tọọrọ ha. Ụmụaka na-asa efere, akwa na ihe ndị ọzọ ruru unyi n'ezinaụlọ. Ọ bụ ụmụaka na-aza ma na-ehichasị ime ụlọ, mbara ezi na gburugburu ebe obibi. Na nchịkọta, Mazi Nnabuihe sị na ọ bụrụ na nne, nne maọbụ ụmụaka arụghị ọrụ dịịrị ha, na ezinaụlọ ahụ ga-enwe nkọjọ n'ụzọ dị icheiche. Maka na ndị Igbo tụrụ ilu sị na ""A na-ama mma n'ụlọ pụwa n'ama""." afirika-44546994,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44546994,IPOB: Anyị ebiela akwụkwọ ntuliaka referandum,"N'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Emma Powerful zitere BBC Igbo, otu Ipob kwuru na ha ejikerela maka agba mbụ n'ime agba atọ referandum ha na-akwado.","IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti Ha sịrị: ""A na-ebi akwụkwọ mbinyeaka nde 40 ma na-akwadokwa ikesaa ha ga obodo niile dị n'Biafra ka onye Igbo ọbụla dịrịla afọ iri naasatọ kwuo uche ha maka nnwereonwe Biafra."" Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụzọ ka ha ga-esi hụ na ndị ndị Igbo sonyere ọfụma n'ikwu uche n'okwu nnwereonwe Biafra ma nyere Ipob aka ihazi ihe ọbụla ha na-eme n'ọdịnihu. Ha kwukwara na referadum ahụ ga-eweghachị nye ndị a na-eme emegbu emegbu nwee ohere ịchọ akaraaka ha nke ha boro na gọọmenti Naijiria nara ha. Ipob kọwakwara n'oku ha na-akpọ maka Biafra abụghị oku agha. Ha chetara Ohaneze na ndị Naijiria na referandum ha na-akpọ oku ya abụghị ihe ahụbeghị mbụ n'ihi na dịka ha sịrị kọwa, Naijiria akpọbuola oku a n'afọ 1961 ebe ha jụrụ ndị ọdịda-anyawụ Kamerun uche ha ma ha achoro isoro Kamerun , nke e mechara kewapụ ha n'udo na enweghị agha ọbụla. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47664242,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47664242,"Father Clement Ugwu: Ndị anyị nwuchiri tọrọ Fada Lazarus Ekwueme, ọ bụghị ndị gburu Fada Clement - Ndị uweojii",Ụmụokorobịa asaa aka ọrụ ha bụ ịtọrọ ndị mmadụ ma napụ ndị nwe ha nde kwụrụ nde ego amaala n'ọnya ndị uweojii n'Enugwu.,"Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kọwaara ndị ntaaakụkọ na ndị ọrụ ya na-achụ ndị isi aba okpu ahụ kemgbe tupu ha anwụchie ha ụnyaahụ. Balarabe kwuru na ndị ntọrị ahụ ha jidere abụghị ndị gburu Fada Clement Ugwu kama ọ gwara ndị Enugwu nakwa ndị ụka Katọlik ka ha dere jụụ na oge adịghị anya aka ga-akpara ndị ọṅụ ọbara ahụ. Ndị uweojii na-enyọ na ha bụ ntọ na-akpa mkpamkpa n'Enugwu steeti Ọ kọwara na ụfọdụ n'ime ha so na ndị gburu otu Fada a kpọrọ Fada Lazarus Ekwueme, onye ha tọrọ n'ụzọ Nsụka. Mana ndị uweojii siri imi n'ala were sipụta ebe ha nọ nwụchie ha na Pọtakọt. Mmadụ asaa ahụ akpọpụtaara ndị ntaaakụkọ bụ ndị sị na mpaghara ugwu nke Zamfara na Kebbi steeti. Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ntọ Otu onye na ndị ahụ a na-enyo enyo a kpọrọ Salisu Mohammed si Zamfara steeti kwuru na ya na ndị otu ya sị mgbago Ugwu Naijirịa bịa biri na Benin, ebe ahụ ka ha si a bịa Enugwu na Anambara na-atọrọ mmadụ. O kwuru na onye nke ikpeazụ ha tọrọ tupu ndị uweojii ejide ha bụ onye ọcha ha napụrụ ezigbo ego. Ndị uweojii nwụdekwara onye ohi ji egbe egbe ụmụaka akpa ike n'Enugwu Kọmishọna,Suleiman Balarabe, ndị uweojii Enugwu steeti ka ọ na-akwa ndị ntaakụkọ okwu Ha gosikwara Otu nwata nwoke gụchara Banking and Finance na UNN were kpebie iji egbe adigboroja anapụ ndị mmadụ ihe ha. Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, onye ahụ a na-enyo na ọ bụ onyeohi si Awgu n'Enugwu steeti aha ya bụ Uche Emmanuel kwuru na ya abụghị onye ohi kama na ya na-eji egbe ụmụaka baa n'ụlọ mmadụ zue ya ohi. O kwuru na egi ya na ezute bụ nke ya ga eji gas obodo oyibo. Akpụtakwara otu n'ime ndị ohi gbagburu onye ọrụ ngo rụrụ Miliken hill Enugwu n'afọ gara aga ya na ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-eme ihe otu nzuzo. Dan Mallan kwuru na ndi uweojii mụzị anya ka azụ ugbua igosi ndị omekome mbe na abụọ nke bụ oke. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53976603,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53976603,Bobrisky New Pictures: Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya,Okuneye Idris bụ onye e ji Bobrisky mara bụ nwata nwoke mechara gbanwee na-emezi ka nwaanyị mana kedụ etu njem a si malite?,"A mụrụ ya n'afọ 1992, n""Ebutte Matta dị na Legọs, ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na 'Kings College' dị na Legọs ma gụọkwa na Mahadum Legọs. Site na mgbe ọ dị obere ka ọ malitere ime ka nwaanyị site n'isi nri, ịsa efere, ịza ụlọ na ndị ọzọ. Ihe ọzọ ọ na-emekwa bụ iji ejiji dịka nwaanyị. E ruru n'ọnwa Mee afọ 2019, Bobrisky kpọpụtara onwe ya dịka nwaanyị, nke butere ọtụtụ nkatọọ n'akara soshal midia ya. Ihe mere ndị mmadụ ji kpụrụ ya n'ọnụ ugbua Bobrisky wepụtara ọtụtụ foto ọhụrụ o sere iji gosi ụwa na ọ gbala afọ iri abụọ na asatọ mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya. @meettherichard kwuru na o nweghị onye Naịjirịa ama ama na-eke ekike ruo ka Bobrisky Lee ebe o yi uwe agbamakwụkwọ Ụwa gbakara mgbe Bobrisky gara emume ncheta nna ya N'ọnwa Jun ka foto fegharịrị ebe bobrisky yi uwe nwoke were gaa emume ncheta nna ya. O yi uwe nwuda ụmụ nwoke, okpu ihu ma wepusie ihe ntecha ya. Ndị mmadụ bidokwara kwuwe ọtụtụ ihe makana ha kwuru na ihe ahụ gbagọjuru ha anya. Ihe ndị ọzọ ikwesiri ị ma maka Bobrisky dịka ọ gbarala afọ 28" afirika-44750118,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44750118,Ipob: Nna na nwa ekpeela udo,"Ụkọchukwu Peace, bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob kwuru na ha na otu na-achikọta Igbo niile bụ Ohaneze Ndịgbo nọ n'ọnọdụ onye tinye mma ya n'ọbọ.","Ihe Rev Peace Gwara BBC Peace kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ ka akụkọ pụtara na ụdiri kepukepu nọ n'ikuku. O kwuru na nke bụ eziokwu bụ na ha na Ohaneze ka nọ n'ụzọ ịchọ udo, nke mere ha jiri nye Ohaneze izuụka abụọ ka ha were leba anya n'ihe niile na-esere ha okwu ma kpanye agwa ha n'ebe Ipob nọ. Ọ sị na ọ bụ maka ọnọdụ a ka ha ji gwa ndị Ipob niile ka ha kwụsị ibuso Ohaneze agha. Ọnọdụ a ga-anọ ruo izuụka abuọ, ọ bụrụ na ihe dị iche adịghị ""anyị ga-ama ihe anyị ga-eme"". Gee olu Peace n'elu. Ihe Ohaneze kwuru BBC Igbo gbakwara mbọ inweta ndị Ọhaneze ka ha kwuo nke mere. Otu onye gbagotere na ya bụ otu, na-achọghị ka anyị kwuo aha ya, gwara BBC Igbo na e nwere eziokwu dị na ya bụ okwu. Cheta na ndị uweojii na-ekwu na ndị tụrụ ogbunigwe na be onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo bụ ndị a na-eche na ha bụ ndị Ipob. Ipob gọrọla aka na ụkwụ maka nke a, ma kwuo na ndị uweojii chọrọ inye ha ajọ aha. Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze kwụkwara na ya echeghị na aka ndị Ipob nọ na ya bụ ogbunigwe a tụrụ na be ya. Ohaneze na-ekwukarị na Ipob bụ nwa ha, mana Ipob na-akọwa na okwu nhazigharị Naịjirịa n'ụdị Bekee na-akpọ ""Restructuring"" Ohaneze chọrọ adabaghị n'ihe ha chọrọ bụ nkewa. Ha hụrụ echiche Ohaneze ka mmegharị anya. Lee etu otu onye na ndị ahụ uweojii kpara aka si zara ọnụ ya n'ihe nkiri a. Onye eboro ebubo" 47465844,https://www.bbc.com/igbo/47465844,Ash Wednesday: Kedụ ihe ịnara ntụ pụtara?,"Taa bụ ụbọchị ndị na-ekpere Kraịst n'ụwa niile na-echecta dịka ụka ụbọchị ntụ ""Ash Wednesday"" na Bekee.","Ash Wednesday:'A gaghị m akwa iko na Lenti' Ọ bụ ụbọchị ndị na-eso Kraịst na-edebe dịka ụbọchị dị nsọ, ha ga-aga nara ntu n'isi, ụfọdụ na-asọkwa ịta anụ n'ụbọchị a. End of Twitter post, 1 Mana gịnị ka ịnara ntụ n'etiti isi pụtara? Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby kwuru na ịnata ntụ bụ iji gosi ndabere anyị nwere n'amara Chineke. Ụbọchị ntụ bụ ụbọchị mbụ n'oge Beke kpọrọ 'Lent' nke ndị ụka Kraịst ji echeta ahụhụ Jịsọs tara mgbe ọ nọ n'ụwa tupu ọ nwụọ, wee binyekwa. Na ngwụcha 'Lent' bụ oge 'Easter' mgbe a ga-eme mmemme maka Jịsoso ikwulite n'ọnwụ. Oge a kpọrọ 'Lent' na-eru ụbọchi iri anọ bụkwa oge ndị mmadụ ji ahapụ ụfọdụ ihe na ndụ ha iji dị ka Chineke. Kedụ ihe iri anọ ji pụọ iche? Dịka ụlọ ntaakụko BBC siri kwuo ụbọchị iri anọ bụ nke dị mkpa n'ebe ndị ụka Kristi nọ. Gịnị ka ị na-agbahapụ n'ụbọchi iri anọ tupu 'Easter' e ruo? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-47779523,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47779523,Rivers Election Collation: Wike awụọla onye Amaechi na-akwado n'ala,Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti emeriela ọzọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Rivas Steeti.,"Mmeri a ga-enye Gọvanọ Wike ohere ịchị nke ugboro abụọ na Rivas Steeti Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti kpọpụtara mmeri Wike n'ehihie Wednezde n'ọnụ vootu dị 886,264 dịka Ọkamụta Teddy Adias bụ onye 'Returning Officer' na ntuliaka ahụ. Content is not available End of Facebook post, 1 Onye AAC bụ Biokpomabo Awara nwetere vootu dị 173,859 iji na-esote Wike n'azụ na ntuliaka emere n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị Mpụtara ntụliaka a bụ vootu si n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na atọ nke mejupụtara Rivas Steeti. Okpuruọchịchị Abua Odua na Gokana enweghi ihe mpụtara ọbụla n'ihi ọgbaghara dapụtara mgbe a na-eme ntuliaka nakwa mgbe a na-agụkọ mpụtara ntuliaka ebe ndị ahụ. Nke a si na mkpesa Gbaranor Godwill Christian mere mkpesa nke a dịka a na-achọ ịgụkọ mpụtara ntulaiaka. Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti malitere ọzọ na Wenezde ịkpọpụta mpụtara vootu ọkwa gọvanọ na Rivas Steeti. Na mkpọpụta vootu nke taa mgbe e dere akụkọ a, Gọvanọ Nyesom Wike nke PDP ji ihe karịrị vootu puku narị ise emeri. N'okpuruọchịchị obodo Ogu Bolo, AAC nwetere vootu 814, ebe PDP ji 11855 vootu. N'okpuruọchịchị obodo Obio-Akpor, AAC ji 7495, PDP nwetere 281164 vootu. Okpuruọchịchị Asari Toru, AAV nwetere vootu 18945, PDP ji vootu 32172. Na nke Degema, AAC ji vootu 5071, PDP nwetere 12133. Ọnụgụgụ vootu sị n'okpuruọchịhcị iri na itoolu bụ PDP: 763,603, AAC: 162,180. Onye nke na-esote Nyesom Wike bụ Biokpomabo Awara nke AAC. Cheta na ha kwụsịtụrụ mkpọpụta mpụtara ntuliaka Rivas Steeti rue n'elekere iri nke ụtụtụ taa bụ ụbọchị atọ n'ọnwa Epụrel. Ha malitere ịkpọpụta mpụtara n'ehihie ụnyaahụ dịka ụlọikpe chabichara ikpe n'akwụkwọ ndị pati AAC na ndị ọzọ gbara ka akwụsị Inec ikpọpụta mpụtara ntuliaka a. Ndị ọrụ Inec si n'okpuru ọchịchị iri na asaa nke steeti ahụ zuruoke ebe ndị ọrụ nchekwa jupụtara n'isi ụlọọrụ ndị Inec dị na Rivers Steeti bụ ebe a na-eme mkpọpụta vootu ahụ. Ndị anya na-ele na ntuliaka bụ Nyesom Wike, bu aka na-achị steeti ahụ, na Awara Biokpomabo, na-azọ ọchịchị n'okpuru pati AAC. Dịka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mpụtara okpuruọchịchị obodo dị iri na ise ndị gụnyere Portharcourt, Ikwere, Andoni, Oyigbo, Eleme, Opobo-Nkoro, Bonny, Okrika. Ndị ọzọ gụnyere Akuku-Toru, Omuma, Tai, Ahoada, Emohua, Etche na ONELGA. N'ime okpuruọchịchị obodo iri na ise ndị a, AAC meriri na abụọ ebe PDP meriri iri na atọ. Mana a kwụsịla mkpọpụta mpụtara ntuliaka a rue n'elekere iri nke ụtụtụ echi bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Epụrel, 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50132371,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50132371,Sheffield United vs Arsenal FC: Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha,"Sheffield egosila na elelie nwa ite, ọ menyụọ ọkụ.","Arsenal bidoro icha ndị sheffield ọkụ dịka asọmpị a bidoro mana ha amaghị na ogbu oge nwere 'Plans'. Ọ bụ na nkeji iri na atọ ka Lys Mousset nke Sheffield sụkara netị ndị Arsenal. Arsenal chọrọ goolu ọnwụ-ọnwụ nke mere ka Bukayo Saka chọrọ i ji aghụghọ nweta Penaltị ma ogbuu bọọlụ hụru arụrala ya were kadị odo odo saa ya ahụ. Arsenal gbalịrị ike ha ma ndị otu Sheffield ji gwongworo dọchie ọnụ postu ha. Ka ọ dị ụgbụ a, ndị Arsenal ji akara atọ aga ndị Sheffield kama ha etufuola ohere i so na otu anọ kachasị. Mmeri a bụ mmerị kacha daa ụda ndị Sheffield meriri kamgbe ha lahachịrị na Premiership. Sheffield bụzị ndị nke itolu na Premiership dịka ha jị akara anọ agbanagharị ị pụ na Premiership. Mana otu ihe doro anya bụ na ndị nkwado otu bọolụ Sheffield ka eme ezigbo mmemme taa. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Onitsha fire: ""Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?" afirika-46684678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46684678,#BabaGoSlow: Ihe mere m ji akpụ ka Ejula- Buhari,Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa asaala onyeisala Muhammadu Buhari ka o kwuchara na ọ ga-anakpụ ka eke ruo mgbe ọ natachara ego niile ndị mmadụ si n'akpa Naịjirịa zuru.,"O kwuru nke mgbe ndị si obodo ""Federal Capital Territory""dị n'Abuja bịara ileta ya n'ụbochị Ekeresimesi na bee ya. Buhari onye nke ga-amlaite achụmta vootu ya n'ọdịda anayanwụ(South-South)Naịjirịa n'ụbọchị December iri abụọ na asatọ kwuru na uche ka dị na iweta ezi nchekwa, nri na ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ ga-ezuru ụmụ Naịjirịa. Ụfọdụ kwuru n'elu soshal midia na ya bụ agwa ịkpụ ka eke bụ ihe mebigoro ọtụtụ ihe na Naịjirịa. Ebe ụfọdụ na-ajụ na ọ natachala ndị otu pati APC dika Babachir Lawal eboro na ozuru ego ndị chọrọ enyemaka akpọrọ IDP n'aha ichafụ. @oladeji_bayo gwara onyeisiala na nsogbu Naịjirịa karịrị ego ezuru ezu. @AkaliCharles3 kwuru na ọ gbagọjuru ya anya ụwa a na-efe efe maka teknụzụ ka mmadụ ka na-ekwu maka ị kpụ ka Eke. Mana enwere ndị kwadoro onyeisiala Buhari @Demurleigh kwunyere onyeisiala Buhari ma kwuo na agwa ụmụ Naịjirịa gbasara ọrụ bụ nwayọ nwayọ nke na-emebi ihe. @AnunobiKc kwuru na ọ dimma ka Buhari jiri nwayọ makana onweghị onye ọsọ n'ije nyere aka n'ọchịchị ndị jigoro ya zupu ego Naịjirịa. @Segs_reloadedx kwuru na ọsọkwa ndị mmadụ kpọọ Buhari adịghị ndụ, ọkpụ ka Eke maọbụ ejula, a ka m kwụ ya n'azụ chịm. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 53381633,https://www.bbc.com/igbo/53381633,Biafra Restoration: Anyị enwetala ya 90 pasenti - Uche Mefor,Osote onyendu 'Indigenous People of Biafra' bụ Uche Mefor ekwuola ihe anọ a ga-eme iji weghachite Biafra ugbua.,"O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụfọdụ ndị okenye Biafra nwere ọhụrụ a gbasara etu a ga-esi weghachite Biafra n'ụzọ tọrọ atọ. Ọ na-arịọ ka ndị niile kwenyere na Biafra gbadosie anya ike sonye Nnamdi Kanu n'ọchịchọ Biafra. Mefor kwuru na ""Ọchịchọ Biafra abụghị naanị ihe anya n'ahụ kama ọ bụkwa ihe ime mmụọ."" Mefor kwuru na Biafra bụ ihe mmụọ ""Anyị eruola pasenti iri itoolu na nchọta Biafra mana pasenti iri fọrọnụ rara ahụ makana ọ bụ ọrụ anyị kwesiri irụ iji nwete ihe anyị na-achọ."" ""Iwu mba ụwa dowagara anya na anyị kwesiri iso n'ọchịchọ Biafra."" ""Ọtụtụ mmadụ eriela ego iji wee kwụsị nchọta Biafra."" ""Ndị otu Indigenous Peoples of Biafra kwesiri ịmata na Biafra dịbụ adị mana ihe anyị na-eme bụ ịweghachite ya."" ""N'okpuru ọchịchị Nnamdi Kanu anyị ga-enwe mmeri."" Ihe nchọta Biafra ga-ewe Mefor kwuru na Biafra nwere ndi mmadụ kwenyere na ya ma nwee oke ala ha. N'okwu ya, ọ bụrụ na anyị ga-achọta Biafra, anyị kwesiri inyocha ka anyị chọpụta ndị niile bụ ndị Biafra mana Naịjirịa ekweghị ka nke a mee. Anyị kwesiri inwee ọchịchị nke Biafra ga-enye ndị nke anyị ohere ikwu uche ha ma mekwa uche ha, ma nwere oke ala ha. Anyị ga-ahụrịrị na ndị ọchịchị nọ na Biafra ga-emeriri uche ndị ha na-achị, ọ bụ etu a ka ndị mba ofesi ga-eji kwanyere anyị ugwu. Anyị kwesiri inwe ọchịchị na Biafra ga-eme ka anyị na ndị mba ofesi nwe mmekọrịta. Uche kwuru na o kwetere na Mazi Nnamdi Kanu na-agbali nnukwu dịka onyeisi Ipob n'ọchịchọ Biafra mana ọ dịmma ka gakwuo n'ihu mee ya bụ ihe ka ọ kwudosie ike. Ihe ndị Okenye kọwara maka etu Ipob si achọ Biafra Ndị okenye abụọ gụnyere Obidi Obienu na Victor Emeka Okeadu tinyere ọnụ n'okwu kwuru na Ipob na ndị isi na-arụpụta ntụziaka a ga-eji nwete Biafra ma na-ekwu na oge zuo ha ga-ewepụta ya. Okeadu bụ odeakwụkwo otu Ipob kwuru na ha anaghị achọ ikepụta obodo ọzọ kama ọ bụ iweghachite obodo dịbụ adị furu efu. O kwuru na ndị mba ofesi ma oke diri Biafra maka ndị na-ajụ maka eserese gbasara obodo a. Okeadu kwuru na iweghachite Biafra dị n'aka ndị mmadụ, ha kwete, a gawa n'ihu. Gọọmentị Naịjirịa na-akatọ IPOB Cheta na gọọmentị Naịjirịa ekwupụtala IPOB dịka otu ezighi ezi n'iwu. Onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu ka bụkwa onye a na-achọ achọ na Naịjirịa. Gọọmentị boro ya ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ichutu onyeisiala. Ya bụ ikpe ka nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45619754,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45619754,Osun State election result: A ga-emegharị ntuliaka,"Onye rụru ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ 'returning officer' na ntuliaka Ọshụn bụ Joseph Adeola Fuwape, ekwuola na a ga-emegharị ntuliaka ahụ.","Ekwugbeghị mgbe a ga-emegharị ntuliaka a O kwuru na ọnuọgụgụ vootu niile a tụrụ na ya bụ ntuliaka gosiri na ihe kewara pati abụọ nọ n'isi erụghị mmadụ ole nwereike ịtụ vootu na 'ward' ndị nke akagburu. Ndị mmadụ nwereike ịtụ vootu ebe a ga-emegharị ntuliaka a dị mmadụ 3598. Ihe PDP jiri gaa APC na ntuliaka a bụ 353. Nke a mere na agaghị ekwunwu na onwere onye meriri ntuliaka a. Ya mere, a ga-emegharị ntuliaka na 'ward' abụọ dị n'okpuru ọchịchị abụọ n'Ọshụn steeti. Ugbua, ọ pụtara na-amabeghị ụbọchị a ga-emegharị ya bụ ntuliaka. Nchịkọta vootu ole PDP nwetara bụ 254,698, ebe APC nwetara 254, 345; SDP nwetara 128,049. BBC gbara Minista na-ahu maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ajụjụ ọnụ maka etu ntuliaka siri pụta. Maazi Mohammed si na obi adịghị amapụ pati ya, ma kwukwa na etu a osi kwụru gosiri ndị otu ha na Oshun na PDP abụghị pati eji egwu egwu. Mana, okweghi ịgwa BBC etu ha si akwado maka mmegharị ntuliaka a, makana ọ sị na ọ ga-abụ ịgbara PDP ama." afirika-47939589,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47939589,Festus Keyamo: 'Waec adịghị mkpa maka ọkwa onyeisiala',"Festus Keyamo bụ onye mgbasaozi pụrụ iche nke Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọsọ achụmta vootu maka ntuliaka 2019, akpala agụ nọ n'ụra aka n'ọdụ.","Fetus Keyamo bụ ọkaiwu nwere agba Na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Channels TV nwere, Keyamo bụkwa onye ọkaiwu nwere agba na Naijiria kwuru na asambodo Waec adịghị mkpa maka ọkwa onyeisiala. Ọ sịrị: ""O nwere akwụkwọ ndị onye na-azọ ọkwa onyeisiala kwesịrị inwe. "" End of Twitter post, 1 ""N'ezie, ọ bụrụ na ị nọọ n'ọkwa ogologo oge, dịka o siri dị n'iwu Naijiria, Waec adịghị mkpa maka ịbụ ọkwa onyeisiala."" Ọ kọwara na ihe dị iche dị n'okwu asambodo Waec nke Sinetọ Ademola Adeleke na nke Buhari. ""Ọ bụ nnukwu iberibe na onye enweghị ikike inye asambodo pụtara n'ama ụlọọrụ nwere ikike ahụ n'iwu aka n'ihu."" Ọnụmmiri Keyamo kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ iwe na soshal midia. Lee ihe ụfọdụ na-ekwu: @ubig1 kwuru na ọ bụ ara ka ibe ya ịsị na Waec adịghị mkpa maka ọkwa onyeisiala, mana asambodo mahadum na nke e ji efe ala nna dị mkpa maka ọkwa minista. @IhoTerence kwuru na Keyamo wụrụ ndị na-elekwasị ya anya n'ala site n'ikwado onye enweghị asambodo Waec ịzọ ọkwa ọchịchị ebe onweghị ike iwe onye ji naanị asambodo waec. @mrboboskie kwuru na ebe ọ bụ na Waec adịghịkwa mkpa ọzọ n'ịzọ ọkwa ọbụla n'ala nna anyị, ka apụtara ndị n'ụlọakwwọ abụghị ndị ndu ọdịnihu. @chosensomto kwuru sị ""mgbe Buhari goro ndị SAN iri na atọ ka ha nọchite ya n'okwu asambodo Waec ka m mara na o leghi ule ahụ"". @d_problemsolver na @7th_wonda kwuru na okwu Keyamo gosiri na ala Naijiria ejighi ikwado agụmakwụkwọ kpọrọ ihe. @koschiforlive kwuru na agbaala n'anwụ ihe nna ya ukwu bụ Buhari gbuchiriela afọ ise. @NAijadailyfeedx na-ajụ etu mba onye nwere naanị asambodo Waec na-achị ga-esi aga n'ihu? Mana ụfọdụ kwadoro Keyamo n'ihe o kwuru. @muskiainoh kwuru na ihe iwu Naijiria kwuru bụ ike Iwu Naijiria kwuru, Waec adịghị mkpa na ịzọ ọkwa ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51848815,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51848815,Coronavirus: Ọrịa a agaghị egbochi asọmpi Olimpiks - Onyeisiala Japan,Praịm Mịnịsta mba Japan bụ Shinzo Abe ekwuola na ọrịa coronavirus agaghị egbochi asọmpi Olimpik nke afọ a ịga n'ihu.,"Abe kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'ehihie Satọde. Nke a na-abịa na-agbanyeghị na coronavirus egbuola ihe ruru mmadụ 28 na mba Japan. Mmadụ karịrị 1,400 ebutekwala ya bụ ọrịa na mba ahụ. Shinzo Abe Praịm Mịnịsta mba Japan Abe kwuru sị: ""Anyị ga-akwụsị mgbasa ọrịa. Egwuregwu Olimpik ga-aga n'ihu dịka e si yibuo ya."" Egwuregwu Olimpik kwesịrị ibido n'ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị ruo abalị itoolu nke Ọgọst afọ 2020. Ọ bụ n'obodo Tokyo nke mba Japan ka ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ. Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị Ịhazi asọmpi a eriela mba Japan ihe karịrị otu tarị yen na ụma atọ (I.35 trillion yen) nke pụtara ijeri paund iri na ụma abụọ ( (£10.26bn). A na-atụ anya na ndị egwuregwu ruru mmadụ 11,091 ga-eso sọọ mpi na Olimpik nke afọ 2020. Mmadụ ndị a ga-esi na mba 206 n'akụkụ ụwa niile abịa. Mana mba Japan na-ekwu na egwu ọbụla adịghị n'ihi na ha zuru ka e mee. Onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ndị si mpaghara ọwụwa anyanwu bụ agbụrụ kacha akpa udo na Naịjịrịa. O kwuru nke a n'ụlọomeiwu ukwu oge ha na-atule okwu gbasara ihibe ngalaba ga na-ahụ maka nwulite mpaghara ọwụwa anyanwu nke a kpọrọ 'South East Development Commission' na Bekee. Onye wepụtara akwụkwọ iwu ahụ bụ Stella Oduah na-anọchite anya Anambra North na Sineti Naịjirịa. Lee ihe ndị ọzọ Okorocha kwuru ebe a Uzodinma na-akwado Oshiomhole Hope Uzodinma na Adams Oshiomhole Gọvanọ Imo State bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya kwụ onyeisioche Pati All Progressives Congress bụ Adams Oshiomhole n'azụ. Uzodinma kwuru nke a oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ n'ogige ụlọ gọọmentị dị n'Owere. Ọ kọwara na o doro ya anya na ụfọdụ ndị otu APC na-agba mbọ ka ha chutuo Oshiomhole n'ọkwa, mana nkata niile ha na-akpa iji chutuo ya ga-ekpudorịrị ha. Uzọdịmma kwuru na ihe kwesịrị ime ugbua bụ ka ndị isi pati ha jikọọ aka ọnụ ma wepụta atụmatụ nke ga-enye ha mmeri na ntuliaka nke afọ 2023. Gịnị mere Buhari na Kebbi steeti? Otu nwoke chóró ikwe onyeisiala n'aka Ndị uweojii nzuzo nke Naịjirịa bụ DSS akọwaala na ha na-eleba anya n'ihe mere oge onyeisiala Muhammadu Buhari gara njem nleta na Kebbi steeti. Mana Peter Nwahunanya bụ ọnụ na-ekwuru ndị DSS kwuru na ha na-eleba ya bụ ihe anya iji mara ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ. Ihe onyonyo ewepụtara na soshal midia gosiri ebe otu onye gbara ọsọ chọọ imetụ Buhari aka. Ọtụtụ malitere ikwu na ọbụ mwakpo ka onye ahụ chọrọ ịwakpo onyeisiala. E mechara kọwaa na ọ bụ onye hụrụ Buhari n'anya nke ukwu nke na-achọ ụzọ ọ ga-esi kwe ya n'aka. Nwahunanya kwukwara na ndị ọrụ ha niile nọ ya oge ya bụ ihe mere ga-enweta ntaramahụhụ maka arụghị ọrụ ha nke ọma. 'Ndị si mba 26 na Yurop bịko abatala Amerịka ugbua'- Donald Trump Trump kwuru na ọnọdụ mba ya maka Coronavirus bụ gbata gbata Onyeisiala mba Amerịka Bụ Donald Trump amachiela ndị mba iri abụọ na isii nọ na yurop ịbata mba ha maka igbochi mfesa Coronavirus ma kwupute na mba ya nọ ọnọdụ gbata gbata. Mmachi a agụnyeghị mba UK nakwa Republic of Ireland ya na mba ndị na-anọghị n'ogige Schengen. Ndị bueterela ọrịa na mba US eruola puku abụọ ebe mmadụ iri anọ na atọ anwụọla. Ebe Turkey akwụsịla ụgbọelu si mba yurop ibata na be ha. Saudi Arabia kwụsịrị ụgbọelu ọbụla si mba ofesi ịbata na bee ha. Sanusi Lamido Sanusi awụchiela na Legọs Sanusi Lamido Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naijiria Eze Kano achụtụrụ achụtụ bụ Sanusi Lamido Sanusi awụchiela Legọs dịka ụlọikpe ukwu nke gọọmenti etiti kpebiri ntọghapụ ya ebe amachiri ya na Nasarawa. Ọtụtụ ndị bee ya gara ọdọụgbọelu dị na Legọs nabata ya ka o si Abuja bata. Sanusi na gọvanọ Kaduna bụ Nasiru Elrufai yi wee si Awe dị na Nasarawa gawa ọdọụgbọelu Abuja ebe ha banyere ụgbọelu na-aga Legọs. Sanusi kpesara ụlọikpe ka ha nye ya ohere ga-eme ka atọhapụ ya na ebe amachiri ya n'Awe. Cheta na gọọmenti Kano chuturu Sanusi n'oche eze maka ebubo nnupuisi. Na mba Afịrịka, Mba Sudan ekwuola otu nwoke nwụrụ nso nso na bee ha bu ọrịa Coronavirus. Nke a ga-eme ya onye mbụ buterela ọrịa ahụ na mba ahụ. Na mba ofesi, World Health organisation ekwuola na mba Europe abụrụla ebe ọrịa Coronavirus kacha akpa mkpa mkpa n'ụwa. Onyeisi ngalaba ahụ bụ Dr Tedros Adhanom Ghebreyesus rịọrọ ka mba niile wepụta ụzọ zuruoke , nzisa ozi nakwa nkwụsị mmekọrịta n'ọha iji wee zọọ ndụ ndị mmadụ. Gịnị na-eme n'egwuregwu? E jirila maka mkpa mkpa ọrịa Coronavirus na-akpa kachapụ emume egwuregwu dị iche iche na mba ụwa n'otu ụbọchị. Ebe onye nchịkọta otu egwuregwu Arsenal bụ Mikel Arteta ekwuola na ahụ na-adị ya mma ka achọpụtchara na o bu ọrịa Coronavirus. Soro BBC Igbo dọt kọm mgbe niile ka ịmata nke na-eme gbasara ọrịa Coronavirus. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị 'Onweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsị ọrụ ike'" media-50915328,https://www.bbc.com/igbo/media-50915328,Stray bullet death: Ọ bụghị onye uweojii gbagburu mmadụ n'Alor- Ndị uweojii Anambra,"Ndị uweojii na steeti agọọla na ọ bụghị onye otu ha gburu onye mgbọ tungburu n'Alọ, Anambara steeti.","Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na onye uweojii gbagburu otu dịmkpa n'Umuokwu, Alọr na Anambra steeti a kpọrọ Nnaemeaka Nnabuenyi ụbọchị Fraide. Dịka kepu kepu ahụ si kwuo, ehi tọpụrụ n'ụdọ n'ụbọchị Ekeresimesi, onye uweojii nọ ọrụ n'ụlọ ọgaranya ebe o mere, were gbaa ehi egbe. Egbe hapụ ehi tụọ dịmkpa nọrọ onwe ya bụ Nnaemeaka Nnabuenyi. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na ọ bụghị onye otu ha kpara mkpamkpa ahụ. Mohammed kwuru na ndị uweojii ka na-enyocha ya bụ okwu iji mata onye mere ihe ahụ, ma dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ kwụsị ịkọ ihe edoghị ha anya. A nwụchiela nwoke zubara n'ime ụgbọelu Ndị isi ọrụ ọdọụgbọelu a kpọọ FAAN anwụchiela otu nwoke dịka ọ gbarịlịrị izubanye n'ụgbọelu n'ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed International Airport' dị na Legọs ụbọchị Fraide. Nwata nwoke ahụ amabeghị aha ya gbarịrị iriba n''wheel ụgbọelu Air-Peace na-aga Owere n'ụtụtụ oge ụgbọelu ahụ na-achọ ifepụ. 'Di m sị anyị lawa na ọ na-abịa - Nwaanyị si South Africa lọta Ọnụ na-ekwuru ụgbọelu ahụ bụ Stanley Olisa kwuru n'ozi o wepụtara na o mere n'ụtụtụ Fraide ebe elekere itoolu. ""Otu nwoke nwere ike ịdị afọ iri abụọ si n'ọhịa tipụta gbalịa isi n'ụkwụ ụgbọelu tibata n'ime ụgbọelu."" ""Anyị gbara ndị ọrụ nchekwa ụgbọelu ama, ha bịa nwụchie ya."" Nke abụghị mbụ mmadụ na-ezubanye n'ụgbọelu na-achọ ifepụ gawa obodo ọzọ na Naijiria. N'afọ 2013, Daniel Ihekina, nwata nwoke dị afọ 15 zubanyere n'ụlọelu si Benin gawa Legọs. Anyị meere Sowore na Dasuki ebere - Malami Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Ọkaiwu gọọmentị etiti na-akọwa na ọ bụ ebere ka gọọmentị wee tọhapụ Omoyele Sowore na Sambo Dasuki bụ ndị e ji n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS. Abubakar Malami kwuru na gọọmentị nwere ikike ijigide mmadụ abụọ ahụ n'agbanyeghị n' ụlọikpe enyela iwu ka a tọhapụ ha. Na Morroco Mohamed Sekkaki A tụọla otu onye na-eme ihe onyonyo 'Youtube' mkpọrọ afọ anọ ma rie ya nha puku dọla anọ maka ịkparị onye eze ndị Morroco. A nwụchiri nwoke a aha ya bụ Mohamed Sekkakị na mbido ọnwa Disemba maka ihe onyonyo o mere nke ndị isi obodo sị na ọ kparịrị eze ha. EPL Onye nkuzi ndị Manchester City bụ Pep Guardiola Manchester City ga-ezute Wolves n'asọmpi English Premier League ụbọchị Fraịde. Wolves meriri Man City oge ha zutere onwe ha n'ọnwa Oktoba, ka anyị lewenu ma Man City enwerike imegwata. Ụgbọelu akpọkasịala ma gbuo ihe ruru mmadụ 15 Ihe akwa arịrị mere ka ụgbọelu bu mmadụ iri itoolu na asatọ (98) kpọkasịrị na mba Kazhastan ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na ise. Akụkọ kwuru na ụgbọelu Bek Air ahụ danyere n'ụlọelu ogogo abụọ, na-erughi nkeji ole na ole o si n'ọdọụgbọelu Almaty felie. Ihe ruru mmadụ 60 gụnyere ụmụaka, merụrụ ahụ na-anata ọgụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ụgbọelu ahụ si obodo Almaty na-aga Nur-Sultan bụ isiobodo mba ahụ, tupu ọ daa. Ụgbọelu ahụ enwurughi ọkụ, mana ọ gbajiri abụọ ka ọ dabachara n'ime ụlọ ahụ. Burna Boy Burna ritere uru dịka ọkaibe na otiegwu mba ofesi Ndị mmadụ na-etu otiegwu a ma ama bụ Burna Boy aha dịka ọ zụrụ ụgbọala chara chara ọzọ. Cheta na e depụtara aha ya dịka ndị nwereike inweta nturuugo Grammy maka 'ọbaegwu kacha mma n'ụwa' n'afọ 2020. 'Typhoon Phanfone' Ndị bi n'obodo Ormoc na-egwufe na mmiri N'ofesi, Ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ n'ajọ ifufe Typhoon Phanfone mere na mba Filipịns eruola iri abụọ na asatọ. Ndị ọrụ gbatagbata na mba ahụ ekwuola na a ka na-achọ ihe ruru mmadị iri na abụọ. Egwuregwu Trent Alexander-Arnold N'egwuregwu, Liverpool ejirila pọintị iri na atọ agafe Leicester City bụ ndị ha nyụrụ anya n'ụbọchị Tọzde. Ebe kepu kepu si mba Itali apụta na-akọwa na Zlatan Ibrahimovic dị afọ iri atọ na isii, nwereike ịlọghachite AC Milan bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ mbụ. Gịnị mere #StarboyFest na #KizzDanielLive ji ewu? Ndị mmadụ na-ama otiegwu Kizz Daniel njakịrị maka etu o si tinye emume ya ụbọchị Wizkid tinyere nke ya. Ha na-asị na nke ya emeghi ọfụma etu o kwesịrị makana Wizkid kpọkọrọ ndị niile gaara eme ka nke ya kpoo ọkụ etu o chere. E mechiela ụzọ Shagamu Ihe mberede ọkporoụzọ mere n'okpuru Akwa Shagamu I si mpaghara Ọdịda-anyanwụ aga ala Igbo? Mara na e mechiela akwa Sagamu dị n'Ogun steeti bụ ụzọ ị kwesịrị isi gafee. Nke a na-eme dịka ụgbọala abụọ na-ebu mmanụ agbịdị kụkọtara onwe ha ma nwuru ọkụ gbara akwa ahụ n'ụbọchị Ekeresimesi, nke mere ka ndị nhazi njem okporoụzọ bụ FRSC kwuo na ọnọdụ akwa ahụ adịghịzị mma. Nke mere ọhụrụ Dịka e mechiri ụzọ Shagamu maka ọkụ gbara akwa, ndị na-elekọta ụzọ bụ FRSC, ekwuola na a ka nwere etu a ga-esi gafere akụkụ ụzọ ahụ. Ha kwuru na ha emechiela akụkụ ebe ọkụ ahụ gbara, ma na-agba mbọ ịhụ na ha jikwatara akwa ahụ. Gụzuo maka ya ebe a: Ị na-aga ala Igbo? Mara na e mechiela Akwa Shagamu Liverpool 4 - Leicester City 0 Liverpool asọghị ndị ha bịara ileta n'ụlọ anya, ka ha ji goolu anọ chara acha gbajuchaa Leicester City afọ. Kelechi Iheanachọ bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Leicester City esoghi gbaa ya bụ bọọlụ mana Wilfred Ndidi so gbaa akwụsịnwughi mmebọ e mebọrọ ha n'azụ ụlọ ha. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi" afirika-46667797,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667797,2018 Highlights: Ihe iribama metụtara ndị Igbo n'afọ a,"Ka afọ 2018 ji nwayọ bịara n'isi njedebe, BBC Igbo na-echetara ụnụ akụkọ ndị mere ka obodo kpoo ọkụ n'afọ ahụ.","Content is not available End of Facebook post, 1 Nke gbara ụwa niile gharị bụ akụkọ mpụtagharị Nnamdi Kanu n'obodo Jerusalem kemgbe ọnwa Septemba nke afọ 2017. Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock. BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ ""Fake news"" Ndị na-agbasa akụkọ Jubril sị na ọ bụ ntị ya ka ha na-ele, mana nti Buharị nke aka nri na nke aka ekpe ya adịghị otu Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock. BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ ""Fake news"" Onyeisiala pụtara kwuo na ọ bụghị Jubril. Okwu Fada Mbaka gwara Peter Obi mgbe ọ gara ịka ụka ""Bazaar"" kpokwara obodo ọkụ. Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Atiku na Peter Obi atụnyereghị ụlọụka ya , ha nwere ike ị da na ntuliaka na-abịa Mmepe ụlọọrụ BBC nke mere n'ọnwa Febrụwarị wuru ewu nke ukwu. Ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara emume ahụ Ka anyị mepechara, anyị wetaara unu akụkọ ihe nwunye Nnamdi Kanu gwara anyị gbasara ebe di ya nọ. Okwu o kwuru kpalitere ọtụtụ asịsa n'ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa nakwa gọọmenti etiti nọ. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Akụkọ ọzọ dara ụda bụ akụkọ nwaanyị Igbo akpọrọ Mama Boko Haram. Aisha Wakil gwara BBC Igbo etu o si zụọ ụmụaka bụ ndị otu Boko Haram taa. Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo Akụkọ Ụkọchụkwụ ama ama na Naịjịria mụrụ ụmụ ejima atọ ka afọ iri na itoolu gafechara, nyere ụmụ Igbo nakwa Naịjirịa niile oke obi ụtọ. Di na nwunye mụrụ ejima atọ Okwu Abaribe kwuru maka ndị ọchịehi wuru ewu n'afọ 2018. Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi. Asọmpi iko mbaụwa niile narakwara ụmụ Igbo uche. Russia 2018: Ọgụ 'rimotu' ebidola n'ezinaụlọ ndị a Ọzọ so ya bụ akụkọ nwuchi ụmụnwaanyị Ipob otu narị na iri anọ n'Owere. Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa. Mmiri ide kpara mkpamkpa n'ala Igbo n'afọ 2018. Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha. Akụkọ ha kpalitere nkata a na-akpa maka IVF. Ụmụnwaanyị ise si n'ụlọakwụkwọ Regina Pacis dị n'Onịcha kpakwara ndị Igbo mgbe ha turu ugo n'asọmpi Technovation 2018 site n'ịbụ ọkaibe n'ụwa niile. Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis Akụkọ ndị ga-amasị gị:" akuko-ndi-ozo-43073984,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-43073984,NAPTIP akpọchiela otu ebe a na-atụ mgbere ụmụaka,"Otu na-ahu maka imegide ndi na-atụ mgbere ahia a kpọrọ NAPTIP na aha ịchafụ, anụchiela otu dibịa otụmọkpọ na-atu mgbere ahia ụmụaka.","Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa Ụmụnwaanyị ndị ihe dị ọsịsọ na-achọ imụ nwa na-agakwuru ya ka o nye ha nwa. Itụ mgbere ahia ụmụaka aghọla nnukwụ ahịa na-amụtara ndị nọ n'ime ya ọtụtụ nde naira. NAPTIP kpọchikwara ụlọọgwu ọdịnala akụkọ kwuru na dibia ọtụmọkpọ ahụ ji atụ mgbere ahịa ụmụaka. Josiah Emerole bụ ọnụ na-ekwuchitere NAPTIP gwara BBC na a nwụchịrị otụ dibia mgbọrọgwụ na-atụ mgbere ahịa ụmụaka n'Abuja. O kwukwara na akụkọ kwuru na ndị ụweojii nwụchiri otu nwaanyị enwudere na Dịsemba kụ nwa amụrụ ọhụrụ. ""Nwaanyị ahụ kuru nwa ahụ si Abuja na-aga Niger steeti,mgbe e nwudere ya o nweghị ike ikọwa ka ya bụ nwa siri baa ya aka.Ndị uweojii were ya bụ ikpe nyefee ndị NAPTIP. Kemgbe ahụ anyị na-esochi ya bụ dibịa na-atụ mgbere ahịa ụmụaka anya rue izuụka abụọ gara aga mgbe anyị nwuchịrị ya. ""Mgbe anyi nwuchiri ya bụ dibịa anyi chọpụtara ọtụtụ ọgwụ mgbọrọgwu oji arụ ọrụ na be ya. Nwaanyị ahụ anwụchirị enwerela onwe ya mana NAPTIP nara ya nwa ahụ nyefee n'aka ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka ana-emegbu emegbu nke Federal Mịnịstrị FCT. kedu ka ha siri chọpụta na dibia a na-atụ mgbere ụmụaka? Emerole kwuru na nwaanyi ahụ kọwapụtara na onweghi afọ ime ha kpụrụ. Na ya bụ dibia na-enye ha ọgwụ na-eme ka ha dị ime. Orue mgbe ha ga-amụ nwa dịka ndi ụwa chere,dibịa ahu ekuru nwa kunye ha. Emerole gara n'ihu kwuo: ""Anyi na-enyocha ihe nwaanyi a kwuru ka anyi mara ebe ya bụ dibia si ekute ụmụaka ọ na-ekunye ụmụnwaanyị ndị a."" Itu mgbere ụmụaka agbalitela nso nso a n'ọwụwa anyanwụ Naijịrịa.Ọfọdụ ka anwuchịgoro,ọfọdu ka nọ n'ọsọ." afirika-47857513,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47857513,2019 Election: 'Ndị Abịa na-eru uju maka ntuliaka e mere',Ọnụ na-ekwuru Alex Otti bụ onye zọọrọ okwa gọvanọ n'Abia steeti n'okpuru pati All Progressives Grand Alliance (APGA) bụ Maazị Kasie Uko tinyerela ọnụ n'oku onye nnyemaka Okezie Ikpeazu gwara onyeisi ya.,"Alex Otti nke APGA Maazị Uko jụrụ: ""kedụ ihe na-atụ ha (PDP) egwu maka na Otti gara ụlọikpe pụrụiche ị sị ka enyocha ya bụ ntuliaka?"" Ọ sị na ọ bụ aka ọrụ ndị otu pati ahụ ịkọ onye ọbụla pụtara ịmezi obodo ọnụ. Maazị Ifeanyi Umere na-arụrụ aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ọrụ dịka onye nnyemaka pụrụiche sị Alex Otti ya biko gbara ọgwụ ya ṅụọ. Umere kwuru nke a mgbe ọ na-azahachi okwu gbasara ịkpụpụ n'ụlọikpe nke Alex Otti kpụpụrụ Gọvanọ Ikpeazụ ebe ọ na-arịọ ka ụlọikpe doo doo doo kagbuo mkpebi Inec maka ntuliaka nke gọvanọ emere n'ọnwa Maachi maka okpuru ọchịchị iri na ise (15) nke steeti ahụ ọ sị na nrụrụaka gbarụrụ usoro eji eme ihe. Umere sị na ""ịga ntuliaka amarala Otti ahụ"" ebe ya bụ akwụkwọ ọgbara n'ụlọikpe gosiri ya ka ọnye ""enweghị ukwu na nghọta"". Maazị Uko sị na ya bụ ọnụ a na-akọ Otti enweghị isi ma ọlị. Ọ sị na ndị Abia aṅụghị ọṅụ ụbọchị akpọrọ mpụtara ntuliaka ahị nke gosiri na ndị Abịa nọ n'iru uju. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44767787,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44767787,Ihe NLC ji gbachie MTN na steeti dị icheiche,"Otu abụghị otu gọọmentị na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ Naịjirịa bu nke akpọrọ Nigerian Labour Congress (NLC) n'asụsụ Bekee agbachiela ụlọọrụ MTN, bụ ndị na-enye olu ekwenti na steeti dị icheiche na Naịjirịa.","Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ Ndị NLC sị na ihe ha na-eme na ụlọọrụ MTN bụ maka ""ụlọọrụ a adịghị eme ihe ha kwesiri imere ndị ọrụ ha na Naịjirịa"". Mgbachịe ha na-eme na MTN ga-eru ụbọchị atọ. Ha kwuru na MTN ji ndị Naịjirịa eme odibo ma na-akwụ ha ụgwọ na erughi ihe ha kwesiri ịkwụ ha. Ụlọ ntaakụkọ Guardian dere na onyeisi ndị NLC n'Enugwụ bụ Virginus Nwobodo sị na ndị isi MTN ekweghi ka ndị ụlọọru ha soro ndị NLC maọbụ otu dị ka ya. O kwukwara na ha ekweghị ige ntị mgbe niile ha chọrọ ha ga maka okwu a. Ndị NLC sị na ndị MTN na-emegidi ndị ọrụ ha na Naịjirịa Ndị mmadu na Twitter na-egosi ihe ha hụrụ mgbe ha zutere mgbachi a ndị NLC na-eme n'ụlọọrụ MTN. Lee ihe ụfọdụ kwuru. @Jimlayinka tinyere ihe onyonyo a na Twitter @michaed2012 tinyere foto ndị a na Twitter. @solacebase tinyere onyonyo a ọ sị si Kano @Gbenga4Glory tinyerkwara nke Kano. Ndị MTN na onwe ha asaala ihe a na-eme ma kwuo na mmebi ha mebiri akụnaụba ha bụ ihe iwe. Ha kwukwara, site n'ozi a ha zịpụrụ na Twitter ha na onwere ndị ọrụ ha emerụrụ ahụ, ma kwuo na onweghị mgbe ha jiri kwụsị ndị ọrụ ha iso ngalaba ọbụla ha chọrọ iso." afirika-57198878,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57198878,Katsina Catholic Priest: Ndị ntọ atọhapụla ụkọchụkwụ Katọlik a tọọrọ na Katsina Steeti,Ndị ntọ atọhapụla ụkọchụkwụ ụka Katọlik na Dayọsịs Katsina bụ Fada Fr Joe Keke.,"A tọrọ Fr Keke dị afọ 75 n'abalị Tọzde abali 20 nke ọnwa Mee(20/5/2021) dịka ndị ntọ wakporo ụlọụka St. Vincent Catholic Church na Katsina steeti mana e gburu ogbo ya bụ Alphonsus Bello dị afọ 33. Nị mmadụ na-anwụrị na atọhapụla Fada Joe Keke Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik na Dayosis Sokoto bụ Christopher Omotosho, onye gbaara BBC Igbo ama a n'ụbọchị Tọzde n'ozi o zitere, kwuru na Fada Keke na-anata nleta n'ụlọọgwụ ugbua. ""Anyị anabatala Fada Joe Keke n'aka ndị ndị tọọrọ ya. Ugbua ọ na-anata nleta n'ụlọọgwụ."" Fada Omotosho kelere Chineke ma kelekwa ọha ndị mmadụ kpere ekpere mgbe aka ji Fada Keke. Katsina Catholic Priest: Etu ndị ekperima si wakpo ụlọụka Katọlik na Katsina Steeti, gbuo otu ụkọchukwu Fr Joe Keke dị afọ 75 atọọrọ n'abalị Tọzde mana enwebeghị onye hụrụ ya ruo ugbua Ndị ekperima wakporo ụlọụka St. Vincent Catholic Church na Katsina steeti n'isi ụtụtụ Fraịde, gbuo otu ụkọchukwu, ma tọrọ ụkọchukwu ọzọ. Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik na dayosis Sokoto bụ Christopher Omotosho kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ na Fraịde. Omotosho kwuru na ndị ekperima ahụ kpụụrụ ndị ụkọchukwu abụọ oge ha wakporo ya bụ ụlọụka, mana e mechara hụ ozu otu n'ime ndị ụkọchukwu ahụ. Anya ahụbeghi ụkọchukwu nke ọzọ ruo ugbua, dịka Omotosho si kwuo. Aha ụkọchukwu abụọ a bụ: Joe Keke, onye gbara afọ iri asaa na ise; na Alphonsus Bello, dị afọ iri atọ na atọ. Ndị ekperima wakporo ụlọụka St Vincent Catholic Church na Katsina steeti n'isi ụtụtụ Fraịde, gbuo Fr. Alphonsos Bello dị afọ 33 Ọ bụ Alphonsus Bello ka a hụrụ ozu ya, ebe Joe Keke bụ onye a kpụụrụ pụọ. ""Anyị amaghị ebe a kpụ ya gawa, ndị ekperima ahụ akpọbeghị anyị n'ekwentị,"" Omotosho kwuru." afirika-47684905,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684905,Breast Ironing: Ị nụtụla maka omenala ịpịatu ara nwaanyị?,Ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Briten chọrọ ịmalite nkuzi maka omenala a n'ụlọakwụkwọ ha.,"Ha kwuru na ọ dị mkpa ịme nke a iji chekwa ụmụaka ụmụnwaanyị na mmegbu na mkpagbu so ya bụ ihe. Otu onye omeiwu na Briten bụ Nicky Morgan kwuru na ""ndị nkuzi nwere ọnọdụ dị mkpa n'ịgbasa ozi gbasara ya bụ okwu. Ngalaba ọzọ chịkọtara ihe na-eme na mba ahụ kwuru na ""ọ bụ ọrụ ndị nkuzi ịkwuputa okwu maka omenala ahụ"" Gịnị bụ ịpịatu ara nwaanyị? Omenala a pụtara ịpịatu ara ụmụaka ndị nwaanyị ara ha ka na-eto ọhụrụ. A na-eji okwute dị ọkụ maọbụ mma dị ọkụ e dee ara nwata nwaanyị iji kwụsị ya otito maọbụ mee ka ọ daa ada. Oge ụfọdụ a na-eke akwa n'obi nwata nwaanyị ahụ iji pịatu ara ahụ nke na-eru ọnwa ole na ole. ""Ịkwesighi ịbe akwa"" Ndị gwara BBC maka ahụmihe kọwara na ịkwesighi ịbe akwa ma a na-eme gị ihe a. ""I bee akwa, i wetala ezinaụlọ gị mkparị na mmebọ"" ka Kinaya* gwara BBC. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ nne ha maọbu nne nne ha na-eme ha ihe ahụ Na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ebe omenala a siri malite, ha kwenyere na ihe a ga-eme ka anya nwoke pụọ n'ahụ ụmụaka ndị nwaanyị. Kinaya* abụghị ezigbo aha nwaanyị ahụ, BBC gbanwere ya iji chekwa ya." afirika-53075807,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53075807,Twitter voice note: Ihe ị kwesịrị ịma maka ya,Soshal midia na-enwu ọkụ maka atụmatụ ọhụrụ Twitter wepụtara a kpọrọ 'Twitter voice note' nke ga-eme ka i zipu olu gị n'ọba ozi ha.,"Ụlọọrụ Twitter sị na nke a ga-adị ire naanị n'igwe ekwentị bu akụrụngwa iOS ugbua. I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch?? Ha sị na ha mere nke a maka na ọtụtụ ozi ndị mmadụ nwereike ifu maọbụ aghọtaghie ha n'akara edemede, mana olu okwu mmadụ agahị eme etu a. Mana ndị nwere ekwentị bu akụrụngwa 'Android' na-ewe iwe etu Twitter ji ghara itinye ha n'atụmatụ a. Ihe ị kwesịrị ịma maka ya: Oge mmadụ nwere ikwu okwu bụ tịnkọmtịnkọm 140 nke bụ nkeji abụọ na tịnkọmtịkọm 20. Ị nwereike iji ya zie ozi ugboro ole ọbụla ị chọrọ na Twitter. A naghị eji ya akparịta ụka dịka ọ dị na 'Whatsapp' kama ọ bụ naanị izipu ozi. I nwereike ị na-ege ntị n'olu ozi a ma na-emekwa ihe ndị ọzọ n'ekwentị gị. Ụzọ ise ị ga-eji tinye olu gị n'ọba ozi Twitter Mepee ọba ozi Twitter gị ma pịa aka n'ebe ị ga-edebanye ozi. Pịa aka n'akụrụngwa na-egosi igwe e ji ekwu okwu. Pịa ya aka ma malite kwuwe ozi ọbụla ị chọrọ izipu. I nwereike ịgbakwụnye mkpụrụokwu edemede n'olu gị ahụ maọbụ tinyekwuo olu gị ọzọ. Mgbe ọbụla ị dị njikere izipu olu gị a, pịa aka n'akara nzipu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44317353,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44317353,Zinedine Zidane ahapụla Real Madrid,Zinedine Zidane arituola n'ọkwa dịka onye nkụzị otu egwu bọọlụ Real Madrid.,"Zidane so na ndị kachasị ritere otu egwuregwu uru na obere oge n'ụwa niile Zidane bụ onye France (mana nne ya na nna ya sị Algeria) ritere iko mbaụwa na Champions League mgbe ọ na-agba bọọlụ nke onwe ya. Ọ gara Real Madrid n'afọ 2016 mgbe Rafael Benitez rituru ma nyere ha aka rite iko Yurope nke 11 ha. Mana, onweghi onye ga-ekwe na Zidane ga-emenwu ihe o mere, nke bụ ibute Champions League ugboro atọ, ma butekwa iko nke Itali akpọrọ La Liga. Ọ bụ n'izuụka gara aga ka Madrid buru otu egwuregwu nke mbụ n'ime afọ 40 butere iko Yurope atọ n'usoro. Mmeri a ha nwetere mere Zidane ka o soro na ndị nkụzị egwuregwu bọọlụ kachasị gbaa mbọ, ihe tụrụ n'anya makana ọ mere nka n'ime afọ atọ. Zidane, bu onye dị afọ 45, kwuru na ya agaghị abụzị onyendụ ndị Madrid na ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere tata n'ọgbọ egwuregwu ndị Madrid dị na Valdebebas na Itali. ""Ahụrụ m otu a n'anya, nakwa onyeisi ya bụ onye nyere m ohere ị rụ ọrụ ka onye ndu otu a masịrị m. Mana, ihe niile na-agbanwe bu ihe mere m jiri mee mkpebi a,"" O kwuru. Florentino Perez, bu onyeisi Madrid kwuru: ""Anyị atụghị anya ihe a chaa chaa nke mere taa jiri bụrụ oge akwa n'ebe mụ na ndị niile na-arụrụ otu a orụ. Mgbe ọ gwara anyị na ya ga-apụ, anyi nabatara ya."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-43098670,https://www.bbc.com/igbo/media-43098670,Iko FA: Man United emeriela Huddersfeild na asọmpị kpụ ọkụ,Manchester United emeriela Huddersfeild n'asọmpị iko FA n'ụbọchị Satọdee.,"Romelu Lukaku enyela goolu karịrị iri abụọ n’asọmpị dị icheiche n’afọ anọ garaaga Ha nyere ha ọkpụ abụọ ana asataghị otu. Romelu Lukaku bụ onye nyere goolu nke mbụ n'nkeji atọ. Goolu nke abụọ batara na nkeji iri ise na ise. Manchester United ji mmerị nke a bata na agba nke atọ tupu nke ikpeazu. Lukaku bụ onye ala Belgium enyeela goolu nke iri abụọ na otu asọmpị nke a. Manchester United na-enwe olileanya na ha ga-emerị asọmpị iko FA n'afọ a. Ọ bụrụ na ha merie asọmpị nke a, ọ ga-abụ ugboro iri na atọ ha meri yabụ iko." afirika-46708466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46708466,Shehu Shagari: Ihe ndị o mepụtaara ụmụ Naịjirịa,"Ndị mmadụ ka na-eti ezinaụlọ onye chibụru Naịjirịa site n'afọ 1979 ruo 1983 bụ Shehu Shagari, aka n'obi kemgbe ọ nwụchara n'abalị ụbọchị December iri abụọ na asatọ nke 2018.","Ndị dịka onyeisiala Buhari kasiri ndị be ya ọ hapụrụ obi ma rịọ ka Chukwu nọnyere ha n'oge a. End of Twitter post, 1 Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa kwukwara maka ọrụ ọma Shagari rụru dịka onyeisiala. Mana onwere ihe ndị Naịjirịa agaghị echefu maka nwoke a chịrị ha dịka onyeisiala n'afọ 1983? Nke mbụ ha agaghị echefu bụ ihe a kpọrọ ""Green revolution"", nke mere ka agụụ ghara ịnyụ ụmụ Naịjirịa ịkpakwụ. Ọ rụpụtaara ụmụ Naịjirịa ọtụtụ ebe obibi dịka nke a kpọrọ ""Shagari Estate"" dị na Legọs, ma mekwa ka ego ya ghara ịdị ọnụ. O tinyere ego na Delta steel, Ajaokuta steel nakwa Steel Rolling Mill. A na-eji steel arụpụta ọtụtụ ihe e ji arụpụta ụlọ, akwa, na ihe e ji edozi obodo. Ndị Igbo agaghị echefu etu o si họrọ Odogwu Alex Ekwueme dịka osote ya. Dr Alex Ekwueme bụ ọnye ndọrọndọrọ ọchịchị a mara dịka onye nwere ọtụtụ nzere agụmakwụkwọ mahadum Makana ha na-eche na ihe o mere nyere ndị Igbo ọnụ okwu ọzọ na Naịjirịa kemgbe alụchara agha Biafra n'afọ I970. Ndị ọzọ dịka Ben Murray Bruce bụ sinetọ, tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ. Ọ chịrị dịka minista ugboro asaa maka ezigbo agwa a hụrụ n'ime ya. Shagari bụ minista na-ahụ maka nkwalite akụnaụba obodo n'afọ 1970, minista na-edowe ego ndị n'ala ezumike nka n'afọ 1962, minista na-enyocha mpụ ndị uweojii na-eme nakwa minista na-ahụ maka idozi Naijiria n'afọ 1967. Ọ rụkwara dịka kọmishọna na-ahụ maka ngalaba dị iche iche n'ọdịda-anyanwụ steeti dị n'Ugwu Awụsa. Ọ bụ ya bidoro ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa n'afọ 1979 mgbe o meriri na ntuliaka dịka onyeisiala. N'afọ 1979, Shagari zọtara oche onyeisala mana n'afọ 1983, Muhammadu Buhari bụ onyeisi ndị agha Naijirịa mgbe ahụ, napụrụ ya ọchịchị n'ike. Akụkọ kwuru na kamgbe afọ 1986 ka a kwụsịrị Shagari ime ihe ọbụla gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ka Shehu Shagari si nwụọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49524789,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49524789,Igbo Markets: Etu e si nweta aha ahịa anọ dị n'ala Igbo,Ahịa bụ ebe ndị mmadụ na-aga ere ihe ha nwere ma zụrụkwa ihe dị ha mkpa.,"Ahịa n'oge gboo. N'ala Igbo, ahịa nwere mpụtara dị oke mkpa n'ihi na e kwenyere na ma mmadụ ma mmụọ na-agbakọ n'ọgbọ ahịa. N'ọtụtụ ebe n'ala Igbo, ọgbọ ahịa bụkwa ebe a na-anọ eme emume dị icheiche n'obodo, dịka ịgba mmọnwụ maọbụ ịgbapụta egwu, dgz. Aha ahịa e nwere n'ala Igbo bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Kedụ ka aha ndị a si bido? Ahịa Ugwuagba Obosi Dịka Mazị Chiagozie Nnabuihe, onye ọkammụta asụsụ na omenala Igbo na mahadum Legọs si kwuo, nke a malitere kemgbe e kere ụwa. Ọ kọwara na aha ahịa anọ ndị a bụ aha chi anọ nke Chukwu okike nyere ikike ilekọta ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu nakwa ndịda. Ọ kọrọ sị: ""Chukwu kere ụwa ebe ọ dị okirikiri, o wee zie anyanwụ ka o si n'aka nri na-aga njem ileta etu ihe siri dị n'ụwa ruo n'aka ekpe."" ""Nke a mere e ji nwee ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ."" ""Chukwu zikwara ọnwa ka o si n'ihu maọbụ n'ugwu na-aga njem ruo na ndagwurugwu maọbụ ndịda."" ""Nke a kewara ụwa ụzọ anọ nke kpatara Igbo ji nwee ahịa anọ na-anọchịte akụkụ anọ nke ụwa."" BBC Igbo kpọtụkwara ọka nkuzi Nkechi Nwokoye, onye bụkwa onye nkuzi asụsụ na ọdịnala Igbo na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka. Nwokoye kwuru na ahịa ọbụla nwere chi ọ bụ. O kwuru sị: ""Eke, Orie, Afọ, Nkwọ, ha niile bụcha arụsị nke nnanna anyị ha na-efe n'oge gboo."" ""Nke ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ bụ. Aha ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ pụtara."" ""Mana o nweghi onye ma ihe e jiri baa ha aha ndị ahụ maọbụ mpụtara aha ndị a."" Nkwenye ndị Igbo gbasara aha ahịa ha Ọgbọ ọkụkọ Nnabuihe kọwara na ndị Igbo kwenyere na mmadụ na-adị ndụ naanị abalị anọ: Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. O kwuru sị: ""Afọ, ọnwa nakwa izu ndị Igbo bụ naanị abalị anọ"" ""Ị nọrọgodi ndụ ruo otu puku afọ, ọ bụ naanị abalị anọ."" ""Nke ị nọghị n'eke, ị nọrọ ya n'orie, nke ị nọghị n'orie, ị nọrọ ya n'afọ, nke ị nọghị n'afọ, ị nọrọ ya na nkwọ."" A na-ejikwa aha ahịa agụ mmadụ aha. Aha ndị a gụnyere Okeke, Okorie maọbụ Okoye, Okafọ, Okonkwọ, Nweke, Nworie maọbụ Nwoye, Nwafọ, nakwa Nwankwọ. Nke ụmụnwanyị bụ Mgbeke, Mgborie, Mgbafọ, na Mgbankwọ maọbụ Mgbọkwọ. Etu e si ehibe ahịa Ndị aha kwuru n'ọnụ ihe oriri adaala n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria Tupu e hibe ahịa ọbụla n'ala Igbo a ga-achụ aja. Nnabuihe kwuru na ọ na-abụkarị isi mmadụ ka a na-eji achụ aja dị otu a. Mana ọ ga-abụ isi 'onye ara', ọ bụghị onye ahụ zuru oke. ""Nke ahụ kpatara na mmadụ rịawa ara, ma o rubeghi n'ahịa tụtụrụ ihe, a ka nwere ike ịgwọta ya. ""Mana onye ahụ ruo n'ahịa tụtụrụ ihe maọbụ rahụ ụra ebe ahụ, ara ahụ agaghịzi enwe ngwọta."" Ahịa ọbụla n'oge gboo na-enwe ukwu osisi dị na ya. Ọ bụ n'ukwu osisi ahụ ka a nọrọ chụọ aja e ji hibe ya bụ ahịa. Osisi ahụ bụkwa ihe ịgba ama na e hibere ahịa ebe ahụ, dịka Nnabuihe siri kwuo. Etu e si azụ ahịa mgbe gboo Mgbanwe ka a na-agbanwe ngwaahịa n'oge gboo. Mgbe gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, anaghị eji ego azụ ahịa. Ihe a na-eme na ahịa oge ahụ bụ 'mgbanwe' maọbụ 'weta isi bịa were isi'. Onye nwere ji ga-abịa gbanwere ede, ebe onye nwere anụ ga-abịa gbanwere azụ. Mana ka oge gatụrụ, e mechara were ego ayoro were na-atụ mgbere ahịa. Ego ayoro Ọmụmaatụ ahịa ndị a ma ama n'ala Igbo Ugbua, ahịa Igbo a kacha mara amara bụ otu Nkwọ Ọnịcha nke a na-akpọ ""Onitsha Main Market"" na Bekee. A na-eche na ọ bụ ya bụ ahịa kacha buo ibu n'ọdịda anyanwụ Afrịka. E nwekwara Eke Ọka, Nkwọ Nnewi, Eke Ekwulobia, Afọ Nnobi dgz. Ha niile dị n'Anambara steeti. Ị gaa na steeti Imo, Orie Amarakụ bụkwa ahịa a ma ama na mpaghara Ọlụ dị n'Imo Steeti. Ndị ọzọ dị n'Imo steeti bụ Eke Ọnụnwa, Afọ Ugiri, Nkwọ Achị, dgz. Enugwu nwere Eke Obinagu, Afọ Obollo, Orie Ezeagụ, dgz. N'Ebọnyị, ị ga-anụ maka Eke Imoha nke dị n'Onueke, Ezza, e nwekara Eke Afikpo, Orie Amasịrị, dgz. Ndị Abịa nwere ahịa Eke ọha dị n'Aba, Orie ụgba n'Ibeku, Nkwọ Amachi na Nsulu, Ngwa, Eke Uzuakọlị dgz. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Mgbe ihe dị mma anyị na-enweta N2000'" afirika-44393954,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44393954,GTB asaala akụkọ gbasara ikpe Innoson,Ọnụ na-ekwuchitere GTbank bụ Oyinade Adegbite ekwuola na akụkọ kwuru na Ụlọikpe tụghapụrụ arịrịọ ha ka a kagbuo mkpebi ụlọikpe mkpegharị nyere ka a kwụọ Innoson ụgwọ abụghị eziokwu.,"Onye ọkaịkpe ji okwu ekwuola na ọ wepụla aka ya n'ihe gbasara okwu a N'okwu ya, Adegbite sịrị na ihe ụlọikpe kachasị gwara onye ọbụla ikpe a gbasara bụ ka ha lọghachie n'ikpe bụ isiokwu nke dị n'ụlọikpe mkpegharị dị n'Enugwu. Adegbite sịrị : ""Ihe anyị rịriọ ụlọikpe bụ ihe gbasara ịkwụnye ụgwọ n'aka ụlọikpe mana ụlọikpe kpụpụrụ mkpesa niile gwa onye ọbụla ka anyị lọghachie na ụlọikpe mkpegahịrị maka isiokwu n'ikpe ahụ nke dị n'ụlọikpe mkpegahirị dị n'Enugwu ndị kpọrọla Innoson ugboro atọ mana ọ zaghị ha. ""Ụlọikpe ekwughị ihe ọbụla banyere GTBank ịkwụ Innoson ego ọbụla."" Akụkọ pụtara n'ehihie taa kwuru na Innoson eritela erere na mkpebi ụlọikpe kachasị (Supreme Court) na Naịjirịa kpebiri tata n'ikpe nke GTbank wegara ịma ma a ga-amachị mkpebi ụlọikpe mkpegharị (Court of Appeal) dị n'Enugwu mere nke kwuru ka ha kwụọ Innoson ego ruru ijeri naira ise. N'akwụkwọ ọnụ na-ekwuchitere Innoson bụ Cornel Osigwe zitere ndi ntaakụkọ o kwuru na mkpebi a sitere na ikpe e kpere banyere ugwo Innoson kwuru na ụlọakụ GTBank ji ha site na nchabi ego eziezi ulọaku ahụ na-achabi n'ego ha. Osigwe kwuru n'ụlọikpe nke ukwu kagbụrụ arịrịo GTbank rịrịọ ka ha ghara ịkwụ ụgwọ a. Ozi a si Innosn kwuru na ọkachamara McCarthy Mbadugha bụ onye du ndị ọkaiwu Innoson gwara ndị ụlọikpe kachasị na ego GTBank ji Innoson bụ ijeri naira 14. Cheta na ụbọchị 9 nke ọnwa Disemba afọ 2014, ulọikpe mkpegharị nke di n'Enugwu kpebiri na GTBank ga-akwu Innoson naira 5,936,126,219.01k. Enyere GTBank ụbọchị 14 ịkwụ ya. Mana GTBank ekweghị na mkpebi a e nyere ma rịọ ụlọikpe kachasị ka o tinye mmachi na ikwụ ụgwọ a. Ọnụ na'ekwuchitere Innoson kwuru na etu ha siri ghọta mkpebi a, GTBank nwere ụbọchị 14 ịkwụ ijeri naira 14 n'aka Deputy Chief Registrar nke ụlọikpe mkpegharị nke Enugwu." akuko-ndi-ozo-43004441,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-43004441,Obaseki: Kwusinụ ibu egbe ma ụnụ chiwa ehi,Onye isi Edo steeti bụ Godwin Obaseki amachiela ichi ehi n'abali nakwa i bu egbe chụ ehị na steetị ahụ.,"Obaseki chọrọ ikwusị ndọrọndọrọ di n'etiti ọchị ehi na ndị ọkọ ụgbo na steeti ya. O kpokọbara kommiti mmadụ ruru asaa na iri n'ime asatọ okpuru ọchịchị ime obodo iji we nyocha ndọrọndọrọ dị n'etiti ndị ọchị ehị na ọkọ ụgbo. Ndị gụnyere na kọmitị a bụ isi oche okpuru ọchịchị ime obodo, ndị uweojii, ndị ọrụ DSS, na mmadụ anọ ndị obodo nọ na Edo steeti. Obaseki kwuru,""Otu puru iche gunyere ndị uweojii, ndị agha na ndị nchekwa dị iche iche na steetị ya ga na-agagharị ma na-enyocha ndị ọchị ehi. Onye ọchụ ehị achọputara egbe n'aka ya,a ga-anwụchi ya ma ya ikpe i bu ngwọ agha maka na ndị ọchị ehị ekwesighị iji egbe ma ha chiwa ehi"" Onyeisi ndị Hausa bi na Edo steeti, Badamasi Saleh nyere ndụmọdụ ka emeputa ụzọ dị mma aga-ejị na-ekpuchi onye ọbụla gbara ama nye ndị nche gbasara ndị ọchị ehị ka aghara ị tufu ndụ ha. Mana Saleh Bayeri, onyeisi ndị Fulani bi na Jos si na ya bụ iwu amara n'Edo steeti enweghị isi maka na ọkpụkpa nrị ehị anaghị abụkari n'abali, ọ bụ nanị i gagharị agari. Onye na-ekwuchitere Gọvanọ Edo bụ Cruso Osagie gwara BBC Igbo na ya bụ mmachị bụ nkpebi ehiri aka n'anya were mee. O si na-etinyere ya iji we zọ ndụ ma chekwa akụ na ụba ndị Edo steeti." afirika-47925003,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47925003,Game of Thrones: Ihe onyonyo anọ wuru ka ya na Naịjiria,Game of Thrones bụ ihe onyonyo a ma ama na mbaụwa niile nọzi n'agba nke ikpeazụ ya ugbua.,"Ya mere mmadụ niile jiri kpụrụ ya bụ ihe onyonyo n'ọnụ kemgbe izuụka ole na ole gara aga. GOT bụkwa aha ọzọ e ji mara ya bụ akụkọ, kpuchiri mba asaa na-azọ ocheeze igwe, na ogbugbu na mpụ so ya. Akụkọ a ga-elebanye anya n'ihe onyonyo ise wuru ewu na Naijirịa ka GOT. 1. THINGS FALL APART Ọ bụ n'afọ 1986 ka ụlọ mgbasa ozi NTA mepụtara akwụkwọ Chinua Achebe bụ ""Things Fall Apart"" dịka ihe onyonyo. Kemgbe afọ ahụ, o bidoro iwu ewu rue ugbua maka etu ndị mmadụ si hụ ya n'anya. Ọ bụ n'ihe onyonyo ahụ ka Pete Edochie, Nkem Owoh na ndị ọzọ siri chakee. 2. SUPER STORY Akụkọ a si n'ụlọọrụ Wale Adenuga ji ndị mmadụ n'ọrụ kemgbe e mepụtara nke mbụ ya n'afọ 2001. Ọ bụkwa abalị tọzde ka a na-egosi ya mgbe ahụ. O nweghi onye ọ naghị amasị n'ezinaụlọ, ma nne na nna ma ụmụaka. Ọ bụ ebe ahụ ka aha ""Toyin Tomato"" siri pụta ma wuwe ewu. 3. CHECKMATE Checkmate bụ ebe a ka Ego Boyo bụ (Ego Nnamani mgbe ahụ), Bob Manuel-Udokwu nakwa Francis Agu nọ chakee n'ihe gbasara ihe onyonyo. Amaka Igwe nke nwụrụ anwụ bụ onye malitere ide ya ma hazie ya bụ ihe onyonyo kemgbe afọ 1986. 4. TALES BY MOONLIGHT Ihe onyonyo a bụ ebe a na-akọrọ ụmụaka akụkọ ifo dị icheiche iji kuziri ha ihe dị mma. Ọ bụ ebe elekere asaa kwa mgbede ụbọchị ụka ka o ji apụta n'igwe onyonyo mgbe ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43962711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962711,Aisha Buhari etiela mkpu maka ihe codeine na-eme n'ugwu awụsa,Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari etinyela ọnụ n'okwu banyere ọgwụ ike na Naịjiria dịka ihe onyonyo BBC mere maka ya pụtara.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ihe nkiri nke ndị na-eme nyocha na BBC bu ndị a kpọrọ 'African Eye', gosiri n'ụbọchi Monde ziri na ụfọdụ n'ime ndị na-arụ ọrụ na ụlọ rụ a na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa tinyere aka na ire ọgwụ ụkwara nwere Codeine n'ụzọ ezighị ezi. Otu n'ime ụlọọrụ ndị akwụsịla ire ọgwụ ukwara Codeine ha, ka ụlọọrụ ọzọ na-agọsị ike na aka ha adịghị na ajọ ihe a. Oriakụ Buhari, na ozi o dere na akara Instagram ya, sị na iwe were ya mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ na adaba na iṅụ ogwu ike, okachasị ka o bu nne. O sị na ihe na-eme kachasi n' Ugwu Awụsa, ebe ọ sị na nwunye ndị gọvanọ steeti dịgasị ebe ahụ tinyere aka ịrụgharị ụlọọgwụ n'ebe a na-agwọ ndị ọgwụ ike na-enye nsogbu na Kogi na Kebbi. N'ubọchi Monde, otu n'ime ụlọ ọrụ kachasị na-imepụta ogwu bụ Emzoe Pharmaceutical kwuru na ha na enyocha ihe BBC chọpụtara. Ọgwụ ụkwara Emzolyn ha na emepụta pụtara na ihe onyonyo a BBC mere. Otu onye na erere Emzor ọgwụ pụtara n'i,e ihe onyonyo ka ọ na-etu ọnụ na ya ga-ere akpati ọgwụ ụkwara nde n'izu ụka. Achụọla ya n'ọrụ. Codeine bụ ọgwụ na-tọkụrụ atọkụrụ enwere ike re sọsọ ma dọkịta onyere akwụkwọ. Mana, akwụkwọ gọomentị dere na nso a, na-atụ aka na ihe ruru ọgwụ ọkwara iko nde atọ ka a na-aṅụ kwa-ụbọchị na sọsọ steetị abụọ n'ugwu awụsa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55608347,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55608347,Universities in Nigeria: Ihe mere ọtụtụ mahadum gọọmenti ebidobeghị 'E-learning',Otu akụkọ na-ewu ewu n'ịntaneti bụ nke ụmụ akwụkwọ mahadum na-ajụ ihe mere na amalitebeghị atụmaatụ 'E learning' nke pụtara iji teknụzụ gụọ akwụkwọ n'intaneti.,"Agụmakwụkwọ akwụkwọ n'ịntaneetị Onye ụlọọrụ National Universities Commission (NUC) na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ụlọọrụ ha wepụtara atụmaatụ ndị ga-enyere ọtụtụ Mahadum aka ka ha mewe 'E learning' mana o nweghị nke ha hụrụ ndị mahadum ndị a tinyere uchu na ya. O kwuru na atụmaatụ ndị a gụnyere 'Nigeria Reserch and Education Network' nke otu ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank' kwadoro, 'Nigeria Universities Network' bụ nke mbụ ha wepụtara nakwa 'Open Education Resources' nke mahadum nwereike ị banye na nkịtị. Onyeọrụ NUC ahụ kwuru na o nweghị nke ndị mahadum gọọmenti ndị a kwere eji mere ihe. Ihe ndị na-egbochi mahadum ndị a ịnabata E-learning Onyeọrụ NUC ahụ kwuru na ụfọdụ mahadum na-ekwukarị na ha nwere teknụzụ nke ha, mere na ha agaghị anabata nke gọọmenti tuziiri ha. O kwukwara na ụfọdụ na-ekwu na ha enwechaghị akụ na ụba ha ga-eji tinye ya bụ atụmaatụ n'ọrụ. O bokwara ya bụ ọdachị n'isi ndị ọkammụta ndị megoro okenye, ndị na-achọghị ịnabata teknụzụ maka agụmaakụkwọ makana o nwereike ịhịara ha ahụ. BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị isi mahadum gọọmenti na Naịjirịa ka ha kwuo ihe mere na ha amalitebeghị 'E learning.' Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Ọkammụta Felix Chukwuneke, kwuru na ọ bụrụ na amaliteghị 'E-learning' n'oge, ọ ga-ebute nnukwu ọghọm n'agụmaakwụkwọ mahadum na Naịjirịa. Ọghọm ndị a gụnyere: Chukwuneke kwuru na o chere na gọọmenti ga- Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-45332620,https://www.bbc.com/igbo/media-45332620,Bianca Ojukwu: Lee ndị na-ama ya aka mgba,Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.,"Ojukwu lụrụ Bianca n'afọ 1994 Bianca kwuputere ebumnuche ya ịzọ ọkwa a n'ọgbọ egwuregwu dị n'Ekwulọbịa n'Agụata n'ime Anambara steeti. Ọ ga-azọ ọkwa a n'ime otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Alliance (APGA). Mana mmeri anaghị abata n'aka Bianca na mfe maka ndị ọzọ na-azọ ọkwa bụ Ifeanyi Uba na Nicholas Ukachukwu. Chetakwa na APGA emebeghị ntuliaka nke patị maka ịhọpụta ndị ga-azọ ọkwa dị iche iche n'okpuru pati ha na ntuliaka 2019. Bianca ọ ga-enwe mmeri? Ifeanyi Ubah bụ otu n'ime ndị na-azọ ọkwa banyere otu APGA n'ọnwa Nọvemba, afọ 2017. Bianca Ojukwu bụ onye meriri n'asọmpị 'nwaanyị kachasị maa mma' na Naịjirịa nke afọ 1988 Akụkọ kọwara na ya na gọvanọ Willie Obiano bụ ezigbo enyi; cheta na ọ kwadoro Obiano oge ọ chọrọ ịzọ ọkwa dịka gọvanọ Anambara steeti. Akụkọ kwukwara na Willie na-akwado Uba ugbua n'ebumnuche ya ịzọ ọkwa sineti. Kedụ maka Nicholas Ukachukwu? Oteela Ukachukwu nọ n'ọkwa ọchịchị dị iche iche n'ụlọomeiwu nta Naijrịa. Ukachukwu bụkwa onye ama ama nke ọma n'ọgbakọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ. Mana naanị ihe Bianca nwere bụ na ọ bụ onye rụburu ọrụ dịka onye nnọchịte anya Naịjirịa na mba Spein. Ugbua bụ oge mbụ o tinyere aka nke ọma n'ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla na Naịjirịa. Mana di ya bụ Ojukwu. Ihe a bụ ihe na-enye ndị na-akwado ya obi ike n'agbanyeghị na ndị dike dịka Ifeanyi Uba na Nicholas Ukachukwu zọnyere ụkwụ n'ọsọ a. Mana Ojukwu bụ onye hibere otu a kpọrọ APGA. Ndị na-akwado Bianca nwere olileanya na APGA ga-enye Bianca ikike a maka ihe ọma niile di ya bụ Ojukwu mere pati ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49534002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49534002,Lagos state: Aka ndị okada 123 si Jigawa bata Lagos dị ọcha - Ndi Uweojii,Ndị uweojii nke Legos steeti ekwuola na ha enyochaala mmadụ 123 sitere Jigawa bata Legos ma onweghị ihe dị njọ ha hụrụ.,"Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ na-akowa na ndị uweojii enyefeela ndị a n'aka gọọmenti nke Legos ma na-atụ anya na gọọmentị Legọs ga-ahapụ ha. Kama okwuru sị na mmadụ 123 a ga-eso usoro gọọmenti Legos steeti tupu ha ebido jiri ọgbatumtum ha agba ọkada. Cheta na gọọmentị Legọs steeti ekwuola etu aka ha si kpata ọtụtụ ndị si Ugwu Awụsa wụbanye obodo ha. Ha kwuru na ha nwụchiri mmadụ 123 kwuru na ha bụ ndị ọkada, ka ha ji ụgbọala gwongworo buru ọkada 48, bata na Legọs. Otu onye n'ime ndị a nwụchiri kpọrọ onwe ya Shuaibu Haruna, kwuru na ọ hapụrụ nwunye ya na nwa ya nwoke na Jigawa, bịa Legọs ka o jiri ọkada ya kpatanwuo akụ o ji elekọta ezinaụlọ ya. Dịka gọọmentị Legọs steeti si kwuo n'elu Twitter ha, ọ bụ ndị mmadụ gbaara ha ama dịka ha kwuru na agwa ha nọ na-akpa n'ime ụgbọala ahụ bu ha edochaghị ha anya. Ọkwọụgbọ bu ha na gwongworo ahụ kọwara etu e si kwụọ ya ụgwọ ka o buru ha bute Oshodi dị na Legọs. Mana ka a gbachara ha ajụjụ ọnụ, enweghi ihe a chọtara n'aka ha. Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na ihe gbasara mmiri nke steeti ahụ bụ Tunji Bello nakwa kọmishọna na-ahụ maka njem bụ Abimbola Oladehinde so kpaa nkata e ji nwụchie ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52613503,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52613503,"Osita Osadebe: Ihe mere o jiri bụrụ 'ọ sọ ndị, o wee ndị'","Chi ji ehihie jie n'ụbọchị nke iri na otu ọnwa Mee, afọ 2007 dịka akụkọ pụtara na oke osisi adaala n'Atani, Anambara Steeti.","Aha a na-etu Osadebe bụ Ọsankwa Otiegwu Stephen Osita Osadebe lakwuru ndị ichie ka ọ nọ n'otu ụlọọgwụ na mba Amerịka ebe ọ na-anata nleta maka ọrịa metụtara ọwa e si eku ume. Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha Tupu Osabede anwụọ ka ọ gbachara afọ 71, o mere onwe ya aha na Naịjirịa nakwa Afrika dịka ọkaibe n'iti egwu ""Highlife, ọkachasị n'afọ 60s, 70s nakwa 80s. A kpọọ aha ya, ọ na-echetara ọtụtụ ndị okenye ndị otiegwu 'Highlife' kpọtụrụ akpọtụ n'oge ahụ dịka Victor Uwaifo, Eddy Okonta, Orlando Owo, Rex Lawson na ndị ọzọ. Osadebe, onye a mụrụ n'Atani dị n'okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambra Steeti n'afọ 1935, bidoro inwe mmasị n'egwu oge ọ nọ n'ụlọakwụkwọ obere n' Ọnịcha. Mana ọ bụ oge ọ gbagoro Legọs, ka o jiri egwu mere ọrụ dịka o sonyere n'otu egwu nke E.C Arinze bụ onye kuziri ya egwu. O mechara gbawa mbọ onwe ya dịka o bidoro otu egwu nke ya ọ kpọrọ 'Nigerian Sound Makers'. Igbo Music: Gịnị mere ndị ọgbara ọhụrụ Igbo ji eleghara ụbọaka anya? Efere egwu mbụ ya bụ egwu o wepụtara n'afọ 1958 nke ọ kpọrọ ""Adamma"". Agha Biafra mere ka ọtụtụ ndị otiegwu Igbo nọbụ na Legọs lọta n'ala Igbo. Osadebe so na ndị gbara ọsọ agha ghara klọọb dị na Legọs ma bido ịnọ n'ụlọ 'People's Club of Nigeria' eme ndị mmadụ obiụtọ, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ọgaranya na-ehi odo oge ahụ. O tipụtara efere egwu, 'Come Again' n'afọ 1965, oge ahụ ka nka ya chawasiri ike. Oreintal Brothers: Maka na m bụ onyeisi, ha chere na m na-eri ego nanị m - Kabaka Oge ya na ndị 'People's Club' na-atọ ka nnu na mmanụ ka o tiri egwu ya ọ kpọrọ, ' People's Club.' N'afọ 1984, o tipụtara egwu ya kachasị wuo ewu nke ọ kpọrọ, ""Ọ sọọ ndị, O wee ndị"" . Nke a pụtara na ihe ọma bịara gị, o nwere ndị ọ dị mma n'obi, o nwere ndị ọ na-agbarụ obi. Ọzọ dịka ya bụ na n'ije ụwa, ihe ọbụla mere nwere ndị ọ dabara, nwee ndị ọ ghọrọ ahịa. Dịka egwu ahụ na-amasị ọtụtụ, ụfọdụ ndị mmadụ na-arụ aka na o nwere ndị maọbụ onye Osadebe ji egwu ahụ ekpechanyere okwu. Ụfọdụ na-arụ aka na ọ bụ ikpe ka ọ na-ekpesara ogbo ya n'itiegwu bụ Oliver De Coque. Mana otu onye egwu ochie doro anya bụ Ron Mbataogu sị na ọ bụghị ihe ọhụrụ. Mgbataogu kwuru na ndị egwu na-eme ihe yiri ibe ya na-ekwosa onwe ha ekworo dịka otu onye n'ime ha kawa nka, onye ọzọ na-etolite n'ụdị ihe ọ na-eme na-akwatụkarị. ""O mere n'etiti Ebenezer Obey na Sunny Ade; n'etiti Erasmus Jenewari na Rex Lawanson."" "" Onye aka ochie na-agbada, o nwee onye ọhụrụ na-emekwa ihe ọ na-eme na-abata, ekworo ga-adị. Ha gab na atụfere onwe ha okwu site n'egwu ha."" Egwu ndị ọzọ Osadebe wepụtara nke ruru narị ise n'ọnụọgụgụ. Ha gụnyere: 'Ndi Ochongonoko' ;"" Makọjọ""; 'Onye ike anatago'; Echi Ebuka; Ife Onye Metalụ; 'Onye Lụsịa O lie'; 'E kesịa n'aka a naa n'obi'; 'Ọyọlima'; 'Uche Chukwu ga-eme'; ' Ọnụ kwube' wdg. Onyinye Osadebe bụ nwa Osita Osadebe a na-akpọ 'Afunwa Elota Nna' Dịka Mbataogu siri kọwaa, ihe ọpụrụiche dị n'egwu Osadebe bụ ilu na okwu o ji eri egwu nakwa ka egwu ya si ada. Mgbataọgụ sị na ""egwu ya na-ada ka egwu ndị ọgaranya. Ọ bụ egwu ngala."" Ọ kọwakwara na ihe mere Osadebe ji wue nnukwu owuwu na 70s na 80s bụ maka ọ bụ isi afụrụ kwawa okpu na ndị na-etiri Peoples' Club' nke ọnịcha oge ahụ. ""Peoples' Club' bụ otu ndị ọgaranya; ndị na-azụ ahịa n' Ọnịcha na Nnewi oge ahụ."" Ihe na agba ndị mmadụ anyammiri maka Osadebe Dịka aha ya ka na-ahụ pụm-pụm ọbụladị afọ iri na atọ ọ nwụchara, ihe na-atụ ndị mmadụ n'anya bụ ọnwụ ntụmadị bagiri ezinaụlọ ya. N'afọ 2009, ka o mechara naanị afọ atọ nna ya jiri nwụọ, Obiajulu, ọkpara Osita Osadebe nwụrụ ọnwụ gbawara ezinaụlọ ha na ọtụtụ ndị ihe Osadebe na-amasị obi. N'afọ 2018, nwa ya ọzọ bụ Okechukwu nwụrụ dịka oke idemmiri buru ya. N'afọ 2019, nwa ya na-etikwa egwu dịka Osadebe bụ Onyinye Osadebe, onye a ma dịka 'Afunwa Elota Nna' nwụrụ ka ọ rịachara ahụ nwa oge. Ọ gbara naanị afọ iri atọ na anọ mpitia wee kwee. Mana ma ọ dị ndụ, ma ọ nwụrụ anwụ, mmụọ Osita Osadebe ka chị ọkụ site n' egwu ndị ọ kụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49175627,https://www.bbc.com/igbo/49175627,Presidential Election Tribunal: 'Ihe anyị nyere Buhari bụ mpụtara ule ya ọ bụghị asambodo Waec',"Onyeọrụ 'West African Examination Council' agwaala ụlọikpe na onyeisiala Muhammadu Buhari mere ule 'Cambridge University Assessment International Education' nke Cambridge na Waec gbakọrọ ma na ihe o nyere abụghị asambodo Waec, ọ bụ mpụtara ule ya.","Akụkọ ndị dị mkpa Keduzị asambodo nke a Buhari ji? Osidehinde Adewunmi onye bụ osote onyeisi Waec rụọrọla ọrụ n'ụlọọrụ ahụ afọ 30 kwuru na Buhari so na mmadụ iri na asatọ lere ule ahụ n'afọ 1961. Ọ gara n'ihu kwuo na Buhari lerere sọbjet asatọ ma nweta ise gụnyere - Oral English- C5; History- A3; Geography- C6; Hausa- C5 nakwa Health Science- C6. Mana mgbe a jụrụ Adewunmi ma mpempe akwụkwọ ahụ ebere ihe o nwetara abụ asambodo waec. Ọ sịrị mba na ""ọ sịghị na waec."". Okwu si n'obi gọọmentị etiti na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari ebibiela otu oyiegwu na-akpa mkpamkpa na Naịjirịa kemgbe afọ iri bụ Boko Haram. Islamic Movement in Nigeria: Anyi ga-akwụsi ngaghariiwe Otu ndị Shia nke onye ndu ha bụ El-Zakzaky ekwuola na ha ga-agba jim na ngaghariiwe ha na-eme nke ha ji ekwu ka a tọhapụ onyeisi ha. N'akwụkwọ ozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde nke onyeisi mgbasaozi ha bụ Ibrahim Musa binyere aka, ha kwuru na mkpebi a bụ n'iji nye ohere ka ekpezie okwu ahụ dịka ndị nwere agba siri tụnye ha n'alo. Cheta na ngagharịiwe a tara isi ndị uweojii na mmadụ nkịtị dịka ndị uweojii na ndị Shia kwatara n'Abuja na nsonso. Buhari ebibiela ndi otu Boko Haram- Ụlọọrụ onyeisiala Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. N'akụkọ ozi ha ziputara, ha kwuru sị na ihe fọrọ ugbua bụ ngwọkọta ihe fọrọ na Boko Haram, ndị omekome gbara ọsọ, ndị alakụba nọ na Maghreb nakwa ụfọdụ ndị omekome si mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka. Cheta na Atiku Abubakar na otu PDP gbara Buhari akwụkwọ banyere ntulikaka 2019 ebe ha na-ekwu na Buhari agụzughị akwụkwọ ịchị dịka onyeisiala. IPOB adọọla aka na nti Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ Ndị otu IPOB etinyela ọnụ ma kagbuo ihe ha kpọrọ mmegide na mkpagbu a sị na ndị agha mere ndị aka ha dị ọcha n'Aba dị n'Abịa steeti. Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara na ndị agha kpụrụ ndị bu isi dada isi, tie ha ihe ma nwụchiekwa ha n'ụbọchị satọde gara aga. Ụmụakwụkwọ Sudan na-ewe iwe Ụmụakwụkwọ yi afe akwụkwọ ha na-eme ngagharị iwe Ị nụrụ ihe na-eme na mba Sudan ebe ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ndị otu ha anọ a gbagburu n'ọgbakọ ha gara n'obodo Kordofan? Ndị agha na-achị obodo ha ejirila maka ya nye iwu sị ka e mechie ụlọakwụkwọ niile dị na mba ahụ bido taa ruo mgbe ha ga-ekwuputa ka e meghee ya. Manchester United na-atụ mgbere Paul Dybala Oge eruola mgbe ndị na-akwado Manchester United ga-ebido imali elu dịka ha na-ekwu okwu ịzụta Paulo Dybala? Akụkọ kwuru na ha na ndị Juventus na-ekwu okwu maka ịzụta nwaamadị a si mba Ajentina. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ" afirika-49814351,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49814351,Samson Siasia: Nne nwa amadị a ka nọkwa n'aka ndị ntọ kamgbe izuuka iri,Onye nkuzi ndị otu Super Eagles nke Naịjiria n'oge gara aga bụ Samson Siasia na-arịọ ka a gbatara ya ọsọ enyemaka maka nne ya ndị ntọrị nwụụrụ kamgbe izuụka iri gara aga.,"Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia, nke mbụ bụ n'afọ 2015. Kamgbe abalị iri na ise nke ọnwa Julaị ka ndị ntọ gara nwụrụ nne Siasia na mmadụ abụọ ndị ọzọ n'obodo ha dị na Bayelsa Steeti. Akụkọ kwuru na ndị ntọrị ahụ kpọrọ nnukwu aha ego ha chọrọ ka a kwụọ ha tupu ha atọhapụ ndị a. Sịasịa sị n'obi agbawaala ya n'ihi na ahụ esichaghị nne ya ike bịa bụrụkwa na ndị uweojii amaghidi chaa chaa ndị tọọrọ ya. N'okwu ya: ""Onweghịzi ihe ọzọ m ma m ga-eme."" ""Ndị uweojii kwuru na ọ rara ha ahụ ịchọta ndị ntọrị mere ihe a."" ""A na m arịọ gọọmentị nakwa ala Naịjirịa nke m ji obi m niile fee, ka ha gbatara m ọsọ enyemaka"". Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ. Siasia kwuru na ya enwebeghị ọrụ ọbụla kamgbe afọ atọ gara aga, bịa tinyekwara mmachi nke otu Fifa machiri ya. ""Ihe niile agwụla m nnọọ ike."" Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia. Nke mbụ bụ n'afọ 2015 ka ọ nọchara abalị iri na abụọ n'aka ha. Atiku na Obi agaals ""Supreme Court"" Uche Secondus, Abubakar Atiku, Peter Obi Abubakar Atiku na Peter Obi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha bụ PDP eburula okwu gbasara onye meriri ntuliaka onyeisiala nke e mere n'ọnwa Februwarị afo pụọ ụlọikpe kachasị na Naịjiria. Cheta na ụlọ ikpe mkpesa kụpụrụ ebubo nrụrụaka ha boro onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu ya bụ APC, ma kwuo na ọ bụ Buhari meriri ntuliaka ahụ n'ezie. Nyenu anyị oche onyeisiala maọbụ Biafra Presidency 2023: A na-akpapụ ndị Igbo na Naịjirịa - Ezeife Aka chiburu Anambara Steeti bụ Chukwuemeka Ezeife ekwuola na ndị okenye Igbo nwekwara ike ịdọnyere ndị otu IPOB ukwu ma ọ bụrụ na oche onyeisiala Naịjirịa erughị ndị Igbo aka n'afọ 2023. Ezeife onye e ji Ọkwadike mara kwuru na ọ bụrụ eziokwu na Naịjiri bụ otu, onye Igbo kwesiri inweta ọkwa onyeisiala na ntuliaka nke 2023. Na be Eliza Boris Johnson, Praịm Mịnịsta mba Briten Ụlọikpe ukwu n'obodo Eliza ekwuola na mmechi e mechiri ụlọomeiwu mba ahụ adabaghị adaba. Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kwuru na ya ekwenyeghi na mkpebi ahụ mana ọ ga-ehubere ya isi. Gee akụkọ ndị na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri: Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-44206959,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44206959,Ndị ụka katọlik n'Enugwu na-esonye na ngagharị iwe taa,Nghagharị iwe ndị ụka katolik bidoro taa na steetị niile dị na Naịjirịa dika ndị na-achị a siri kwu.,"Igwurube mmadụ pụtara maka ngagharị iwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa Ndị ụka katọlik n'Enugwu adịla njịkere isonye ndị ogbo ha na Naịjịrịa niile wee gosipụta iwe ha maka ogbugbu e gburu onye ụkọchukwu na Benue. Ngagharị iwe nke ndị Enugwu ga-ebido n'ụlọụka Holy ghost Cathedral Enugwu ebe Bishop Callistus Onaga ga-ejị nnukwu nchụ aja wee malite ya tata. Onye isi ụka katọlịk n'ụwa niile bụ Pope Francis ezugalarị ndị iche iche si Rome gas Benue ije chọpụta ihe kpatara ihe arụ ahụ jiri mee. A na-enyo na ndị gburu onye ụkọchukwu ahụ bụ ndị ọchụehi na-akpa ike na ya bụ ebe. Ha kara ụka tupu ha bido ya bụ ngagharị iew Otu jịkọrọ ụka Kraịstị na Naịjirịa niile bụ CAN n'aha ịchafụ emebuola nke ha, ugbua bụ ndị ụka katọlik. Nagharị iwe ahụ na-emekọta ọnụ na steeti dị icheiche na Naịjirịa. Anyị ga na-ewetara gị ka ya bụ ngagharị iwe ka ọ si aga. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47127467,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47127467,Tomatoes: Nke awara awa enwere ike ibunye gị kansa?,Ọ ka na-agbagọjụ ndị mmadụ anya ihe mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ji azụkarị tomato rere ure hapụ nke siri ike.,"Ụfọdụ ndị dibia bekee kwuru na ọ bụ makana ya bụ tomato dị ọnụ ala. Okwu a pụtara mgbe okachamara n'ihe gbasara nri na Mahadum ahụike Teknuzu kwuru na iri tomato rere ure nwereike ibunye ndị mmadụ Kansa. Otu nwagbọghọ na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ọ na-amasị ya igoro tomato awara awara makana o sie ya, o sipu nje ọbụla ure nwereike ibute. Ụmụnwaanyị na-ere ya bụ tomato awara awara kwuru na ndị mmadụ na-ebuzo egocha ya tupu ndị mmadụ achọwa nke zuruoke. Mana ọkammụta Ajekhibe kwuru na ọ maghị maka tomato awara awa rere ure ibunye mmadụ kansa mana nri ọbụla rere ure ga-ebunyeli ọrịa kansa. O kwuru na ụzọ atọ mmadụ nwereike ibute ọrịa kansa bụ site n'iri nri rere ure, mmanya maọbụ udiri enyi onye na-eme. Ihe ndi mmadụ na-ekwu n'elu soshal @Nerlong kwuru na nke a pụtara na ụmụ Naịjirịa agaghị erinwu nri ule n'udo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49534000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49534000,Islamic State: E gbuola ndị agha Naịjirịa asatọ na Borno steeti,"Ndị e chere na ha bụ Boko Haram atụola ogbunigwe gburu ndị agha Naijirịa asatọ ebe ndị ọzọ gbabara n'ọhịa na Monguno, Borno steeti.","Onye akaebe gwara BBC na ọ hụrụ ụgbọala bu ozu ndị agha Naijirịa ka ọ na-abanye ebe obibi ndị agha ka ihe a mechara. Akụko na-akowa na ndị omekome a buuru ngwaagha ndị Naijirịa mgbe ha wakpochara ha, gbalaga. O rubeghị izuụka abuọ ka ndị otu Boko Haram wakporo ndị obodo Konduga, Gubio na Magumeri nke Borno Steeti. Ka ọ dị ugbua, enwebeghi ihe ndịagha Naijirịa kwuru maka nke a. Benue na Taraba Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela ọnụ n'ọgụ na mgba dị n'etiti ndị agbụrụ Tiv nke Benue steeti na ndị Jukun nke Taraba steeti nke tara isi otu ụkọchukwu ndị Katọlik abalị atọ gara aga. O kwuru sị ka ndị gọvanọ steeti abụọ a, ndị eze ha (ọkachasị Tor Tiv na Aku Uka nke Wukari) nakwa ndị ndu ndị ofufe nọ na steeti ahụ gbakọta ọnụ kpaa maka etu a ga-esi hụ na ọgụ na mgba a na-eselitekarị isi, kwụsịrị. N'okwu ya nke Femi Adesina bụ ọnụ na-ekwuchitere tinyere na Facebook, o kwuru sị ""Ogbugbu ụkọchukwu katọlik a gosiri na e kwesịrị ịma ihe a ga-eme maka ọgbaaghara a na-eme ihere, ọsịsọ"". Ọ gakwara n'ihu tie ndị ụka Katọlik, ndị Taraba nakwa gọọmentị steeti ahụ aka n'obi maka ọnwụ ụkọchukwu ahụ. Lee ihe o kwuru n'uju: Ụbọchị 100 Ihedioha Aka na-achị Imo steeti bụ Emeka Ihedioha akwadola ngalaba Entraco n'atụmatụ a kpọrọ ""go green, stay clean"" dịka o buputere ụfọdụ ihe e ji ekpofu ahịhịa na atịtị na ihe e ji elekọta gburugburu. Ihe ndị dịka ụgbọala e ji ekpo ahịhịa, so na ngwaọrụ o buputere. N'ofesi, DJ Arafat dị afọ iri ato na atọ mgbe ọ nwụrụ Ihe karịrị puku mmadụ nke gunyere opnyeisiala mba Ivory Coast bụ Alassane Ouattara pụtara maka olili ọnye oti egwu ama ama bụ DJ Arafat. Dj Arafat onye ezigbo aha ya bụ Ange Didier Huon nwụrụ mgbe onwere ihe mbere nke okporo ụzọ n'elu ọgbatumtum ya ọnwa gara aga. Twitter Ihe ịtụnanya mere dịka ndị omekome a na-akpọ ""hackers"" na Bekee, tinyere aka ma si n'ọbaokwu onye nwe Twitter bụ Jack Dorsey dee ọtụtụ okwu na-asa afọ. Mana ndị ụlọọrụ Twitter kwuru na ọ bụghị n'aka ha ka aka enwe si baa n'ofe, kama na o si n'aka ụlọọrụ nwe akara ekwentị Dorsey na-eji ebu ọbaokwu ya. N'egwuregwu, 'Unu nwee okwukwe n'ebe anyi nọ' D'Tigers Ndi otu egwu Basket Bọolụ nke Naijiria bụ D'Tigers eriela ọnụma dịka ndị nke Russia jị ọkpu gọọlu iri asatọ na abụọ nke ha satara iri asaa na asaa were merie ha na agba nke mbu n'asọmpị iko mbaụwa nke Basket Ball na China . Serena Williams Ọkwa Naịjirịa arịala dịka ha nọzị n'ogogo abụọ na tebulu asọmpi African Games a na-eme na Moroko. Naịjiria enwetala ọlaedo iri anọ na isii, ọlaọcha iri atọ na atọ nakwa ọlanchara iri anọ na asaa, dịka asọmpi a na-akwado imechi taa. Serena Williams apịabala onwe ya n'agba nke anọ nke asọmpi US Open, dịka o meriri Karolina Muchova. Cheta na Williams ebuola iko a ugboro isii. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Dora Akunyili: Aka m na-ahụ nwunye m na nrọ" afirika-49234172,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49234172,Anambra Chief Judge: Onwuamaegbu abụrụla nwaanyị mbụ bụ Ọkaikpe Ukwu,Akụkọ dị mkpa nke mgbede Anambara steeti enweela nwanyị mbụ bụ Ọkaikpe ukwu,"Ọkaikpe Ijeoma Onwuamaegbu Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara Steeti eduola Ijem Onwuamaegbu n'iyi ọrụ dịka Ọkaikpe Ukwu nke steeti ahụ Ọkaikpe Onwuamaegbu bụ onye nwaanyị izizi rigoro n'ọkwa na Anambara. Govanọ Obianọ duru ya n'iyi ọrọ n'ogige ụlọ gọọmentị nke dị n'Awka taa bụ ụbọchị Monde. Ọ nọkwara ebe ahụ kwe nkwa ịgbalị ike ya iji hụ na ikpe ziri ezi gbadosiri ike na steeti Anambara. Ndị uweojii achụọla ndị gara ngagharịiwe ọsọ ụkwụeruala Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ ""Revolution Now"" n'ọgbọegwuregwu ""National Stadium"" dị na Legọs. Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbakọrọ iso mee ngagharị iwe na mpaghara dị iche iche, ndị nke gbakọtara na Legọs nọ na mbombo ọsọ dịka ndị uweojii na-achụ ha. Anyị achọghị ịkpa oke agbụrụ n'ala anyị - Trump Onyeisi ala mba Amerịka, Donald Trump, na osote ya bụ Mike Pence Na mba ofesi, Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump etinyela ọnụ n'ogbugbu ndị mmadụ nke mere n'Amerịka n'ụbọchị ụka. Trump katọrọ ịkpa oke agbụrụ nakwa echiche nke na-ekwu na ndị ọcha ka ndị isi ojii nwee ikike ịnọ n'ụwa. Ọ gwakwara ndị omeiwu mba Amerịka ka ha mepụta iwu ọhụrụ iji hụ na onye ọbụla gburu ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ikpe ọnwụ. Nke a bụ maka mmadụ abụọ ji egbe gbagbuo ihe ruru mmadụ 31 na steeti Ohio nakwa Texas n'ụbọchị ụka, abalị anọ nke ọnwa Ọgọst." afirika-43519237,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43519237,Ndị uweojii na Spain anwụchiela otu na-azụ ohu akwụna,Ndị uweoji na mba Spain a tọghapụ la ụmụnwaanyị ruru iri atọ n'itoolu esi na Naịjiria bubata na Spain ị rụ ọrụ akwụna.,"Ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị a ndị emere ntọghapụ bụ ụmụaka anwụchịrị n'ike na Naịjịrịa ma tinye kwa ha n'ọrụ ahụ n'ike. Europol bụ otụ ndị uweoji nke mba Europe ekwuola na ha chọtara ụmụnwaanyị a ebe ha bi n'ime ọgba ebe otu ahụ jichiri ha. Ha sị kwa na otu ahụ ama ama tinyere ụmụnwaanyị ahụ n'ọrụ maka ị kwụghachị ụgwọ ruru nde euro iri atọ ha boro ụmụnwaanyị ahụ. Mmadụ ruru iri asato n'itoolu ka anwụchiri n'okwu a, n'ime ha bu onye egwu Naịjiria ama ama mana enyebeghị aha ya. Ejichiri ya ebe ọ sị Spain a laghachi Naịjiria mgbe ọ rụchara ihe onyonyo egwu ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51717050,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51717050,Pregnancy Care: Ihe 10 ụmụwaanyị dị ime ekwesighi ime,"Nwaanyị lụ ha na dị, ihe ọzọ ụwa na-atụ anya ya bụ afọ ime.","Nke a bụ makana nwa bụ ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ọbụla ọ batara. Ngwa chọrọ mmanya juru oyi, nọrọ ala ka i gere ihe dọkịta Joseph Akinde na-ahụ maka ụmụnwaanyị di ime gụpụtara dika ihe nwaanyị dị ime ekwesighị ime maka ngaramara. 1: Inụ ọgwụ Nwaanyị dị ime ekwesịghị ịnụ ọgwụ ọbụla belụsọ nke dọkịta ya tuziri ya. 2: Mmanya na-aba n'anya Dọkịta Akinde kwuru na nwaanyi dị ime ekwesighị ịṅụ mmanya na-aba n'anya. 3: Gbara 'Akpoola' ọsọ Nwaanyị dị ime ekwesighị na-eyi akpoola ya bụ akpụkpụ ụkwụ gbanitere elu. Dọkịta Akinde kwuru na nke a nwereike ịkwatụ nwaanyị dị ime ma metụta nwa o bu n'afọ n'uzọ na adịghị mma. 4: Ilụ Ọgụ Nwaanyị dị ime ekwesịghị ilụ ọgụ. Akinde kwuru na atụmaatụ nwereike ibute ọnwụ nne na nwa.Ọ mara atụ akụkọ mere eme ebe otu nwaanyị dị ime nwụrụ maka na nwa ya nwoke torola eto kụrụ ya aka n'afọ . Nke a metụtara akpa ebe nwa nke mere ka ọbara gbagbuo nwaanyị ahụ. 5: Njem tere aka Dọkịta Akinde kwuru na nwaanyị dị ime gafegoro ọnwa asaa ekwesighị ime njem tere aka. Nke a bụ makana ime nwereike imewe ya n'ụzọ. Kedụ ihe ọ ga-eme? 6: Ise anwụrụ Nke a adabaghị ma ncha. Dọkịta Akinde kwuru na anwụrụ ọkụ nwereike ime imetụta ụbụrụ nwa e bu n'afọ. 7: Imado afọ n'ala Onye na-eme nke a? I chọrọ igbu nwa na-abịa ụwa? Akinde kwuru na ọnọdụ ndina kachara nwaanyị dị ime mma bụ idina n'akụkụ kama ichewe afo ime ihu elu maọbụ mado ya n'ala. 8: Iri nri ahụ gị anabataghị Nwaanyị di ime kwesiri iri nri ahụ ya nakwa nwa o bu n'afọ nabatara. O rie nri ahụ ya anabaghị, ọ ga na-agbọ sọsọ agbọ. Nke nwereike na-ebute Ike ogwụgwụ. Childbirth: Lee obodo anaghị ekwe nwaanyị dị ime mụọ nwa 9: Egwuregwu ụfodụ na-adịghị mma Ọ bụghị mmeghariahụ (exercise) ka nwaanyị dị ime kwesiri i na-eme. I ma atụ, dọkịta Akinde kwuru na ọdịghị ka nwaanyị dị ime na-agba ọsọ ima aka. 10: Nsori Dọkịta Akinde kwuru na ọ bụrụ na nwaanyị di ime anaghị enwe ọpụpụ nwa, nsori na-adị mma. Mana ọ dụrụ ọdụ ka ụmụnwaanyị di ime kwụsị nsori tupu izu ụka anọ ha ga-eji mụ nwa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ'" afirika-48130559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48130559,"Tiwa Savage eferela Mavin Records aka, feghara Universal Music",Otiegwu a ma ama bụ Tiwa Savage ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke ya na ụlọọrụ egwu ọka ibe n'ụwa bụ 'Universal Music Group' maka ikesa egwu ya n'ụwa niile.,"Akụkọ ndị dị mkpa: Universal Music Group bụ ụlọọrụ ntipụta egwu so na ọkachamma na mba ụwa nke nwere ndị otiegwu kara aka gụnyere Aaliyah,Elton John,Katy Perry na Lady Gaga dịka ndị egwu ha. Cheta na Tiwa Savage nọrọ na Mavin Record afọ asaa ebe ọ nọ tipụta ọtụtụ egwu wuru ewu dịka ""Lover, lover."" N'ozi ekele nke onyeisi Mavin Records bụ Don Jazzy zipụtara n'igwe Instagram ya, o kerele Tiwa maka ""ịbụ ihe mkpalite mụọ"" nye ha n'ụlọọrụ ha ma kwee nkwa ikwado ya dịka ọ na-aga n'ihu. Eze Thailand alụọla onye nche ya ma chie ya ezenwaanyị Eze mba Thailand dịka ọ na-agbasa mmiri nsọ n'isi Ezenwaanyị Suthida Eze Maha Vajiralongkorn nke dị afọ 66, alụọla Generalụ Suthida Vajiralongkorn Na Ayudhya, onye bụ osote onyeisi ndị na-echekwa ya ma mee ya 'Ezenwaanyị Suthida'. Eze Vajiralongkorn onye nwere ụmụ asaa, alụọla nwaanyị ugboro atọ ma gbasa. Eze na nwaanyị ọhụrụ ya a emeela enyị ọtụtụ afọ dịka a na-ahụ ha abụọ n'ọha ọtụtụ afọ mana nke a bụ mbụ a na-akpọ okwu aha banyere mmekọrịta dị n'etiti ha. Suthida na-arụbu n'ụgboelu mba Thai bụ 'Thai Airways' tupu Vajiralongkorn akpọpụta ya mee ya otu na ndị na-eche ya nche n'afọ 2014. O mere ya generalụ n'afọ 2016. Ndị ntọ atọrọla ọgọ onyeisi nche Buhari Mmadụ anọ bu egbe wakporo ma tọrọ Alhaji Musa Umar bụ eze Daura, obodo onyeisiala Muhammadu Buhari n'abalị Wenezde. Umar , onye e kwuru si n'ụlọụka alakụba ebe ọ gachara kpee ekpere pụta ma nọrọ ọdụ n'ihu ụlọ ya mgbe ndị omekeome wụbatara, gbalie egbe elu iji chụsasịa ndị mmadụ ma kpụrụ nwoke ahụ. Ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu n'ugwu Awusa na nso nso a. Na nso nso a , onyeisi ndị uweojii kwuru na opekatampe, atọrọla mmadụ 685 bido n'ọnwa mbụ n'afọ wee rue n'ọnwa Eprelụ afọ a. Naanị abalị ole na ole, a tọrọ onyeisi ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ praimarị nke a kpọrọ 'Universal Basic Education Commission"" bụ Mohammad Mahmood Abubakar na nwa ya nwaanyị abalị atọ. gara aga. Magu amajala ndị gọvanọ n'okwu nchekwa Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC Onyeisi ụlọọrụ EFCC bụ Ibrahim Magu etiwela akị oyibo nsugbe. Ọ sị na ụfọdụ ndị gọvanọ na kwanye ọkụ na nsogbu nchekwa na steetị ha ka gọọmentị etiti were tinyekwuoro ha ego na ego nchekwa a na-enye ha Ndị gọvanọ na afụnye ọkụ na nsogbu nchekwa iji nweta ego-MaguMagu arụala ndị Gọvanọ aka ọjọọ gbasara. Okorocha sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya ike Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwusiela ike na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa maachi. Okorocha kwuru nke a n'akwụkwọ ọ degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu bụ ebe o kwuru na Inec dara iwu site na ijichi asambodo ya. CBN sị na ọtanisi agaghị abịa Osote onyeisi Central Bank nke Naịjirịa bụ Joseph Nnanna ekwuola ka obodo dere jụụ na o bụghị eziokwu anisi ga-alọhachị na Naịjirịa. Onyeisi ọgbakọ ndị otu gọvanọ bụ Abdulaziz Yari kwuru na e lewe anya ka ụsụ dowere ọnụ na ọtanisi nwere ike ịlọhachịte n'ala a afọ na-abịa. Barcelona 3 - 0 Liverpool Ụmụibe n'egwuruegwu, Barcelona etinyela otu ụkwụ n'asọmpi nke ikpeazụ site na mmeri ha jị ọkpụ atọ merie Liverpool ụnyahụ. Goolu abụọ a Messi nyere mere ka goolu ya kụrụ ọnụ na narị isii kpọmkwem n'afọ iri na anọ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị:" 47888199,https://www.bbc.com/igbo/47888199,Arsenal vs Napoli: Arsenal asụọla Napoli akwụ n'Emirates,"Ka Arsenal na Napoli zutere onwe ha n'ọgbọegwuregwu Emirates, ha gosiri Napoli nke tọrọ fada.","Arsenal 2 - 0 Napoli Arsenal gosikwara ihe ha jiri bụrụ ndị dimkpa site n'itinye goolu na mpio ndị Napoli na nkeji 14 e ji malite ya bụ egwuregwu. Aaron Ramsey nyere ya bụ goolu ebe Kalidou Koulibaly nke Napoli ji aka ya nye onwe ha goolu na nkeji 25. Mana ya bụ asọmpi abụghị ofe nracha makana ka o ruchara nkeji 35 asọmpi a malitechara, otu abụọ a ka jigidere bọọlụ nhatanha nke a kpọrọ 50:50%. Arsenal webetara Alex Iwobi na nkeji 67 ka ha ji ya dochie Alexandre Lacazette. Ebe Napoli ritere mpempe akwụkwọ edoedo e ji dọọ Elseid Hysaj aka na ntị maka arụrụala ọ rụrụ na nkeji 46. Cheta ba Arsenal na Napoli akwatabuola ya mbụ mgbe ha zutere n'asọmpi Champions League n'afọ 2013 na 2014, bụ mgbe Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ tie ha mmọnwụ n'ọgbọ egwuregwu nke Emirates. Napoli jikwa ọkpụ abụọ merikwa Arsenal na nke ha gbara na San Paolo. Gịnị ga-eme mgbe ha ga-ezute ịgba ụkwụ nke abụọ na be ndị Napoli? Chel Chelsea 1 - 0 Slavia Prague N'aka nke ọzọ Chelsea na Slavia Prague zutere ma chịpụ ya n'ọgbọ egwuregwu Sinobo dị na Czech Republic. Chelsea jisiri ike jiri otu goolu zara aha nna ha, nke bụ na Slavia Prague gbaara aka lawa na be ha. Chelsea bụ ndị a na-ele anya dịka ""onye ogologo"", ebe Slavia Prague bụ ""onye mkpụkpụ"" na ya bụ mgba. Mana egwu dagharịrị makana ha abụọ tatara ya kọnkịrị ka ha na-anwa ịchọta ọnụ goolu. Nke a bụ mbụ Chelsea na Slavia Prague na-akwata mpi. Chelsea emeriela ugboro itoolu n' asọmpi Europa League a, ebe Slavia Prague merigoro naanị otu ugboro. Akụkọ ga-amasị gị" mba-uba-43342906,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43342906,Trump na Kim a ga-ekwe n'aka nke udo?,Onyeisiala US bụ Donald Trump ekwetala na ya ga-aza Kim Jung-un nke North Korea oku maka ịkpe udo n'ime obodo abụọ ahụ.,"Nkwekọrịta ọhụrụ Trump na Kim ọ bụ enyi oke na nwamba? Onweghị onye tụwara anya na mmadụ abụọ a nwere ike ịkpọ ma ọ bụ za oku onwe ha ma e lewe ka ha bụ nkapi siri pia ọnụ. Ọ bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu gọọmentị ndị North Korea wegara Onyeisiala Trump akwụkwọ ozi a na Washington. Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ sịrị na Kim Jung-un ekwetela na ya ga akwụsị ọsọ ahụ o ji agbakwuru ọgụ site na-ịlele ma ọ bụ rụọ ogbunigwe nke nuklia. Kim sịrị na ya ""enweghị ike ịla azụ na ya bụ nkwa"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nke a bụ okwu gbara ọkpụrụkpụ maka ị chọ udo sirila n'ọnụ mmadụ abuo a puta kemgbe ha malitere ịma onwe ha aka na-ihu. Na-aka ọzọ, ụfọdụ na-eche na ọ nweghị ihe ga apụta na nzụkọ a ahụ maka na ụdị nnkata a kwesisiri ị nwe ụbụbọ akọ na uche miriemi maka ị hazị ya. Ndị otu a kwetere na ya bụ ọrịa abụghị ụkwara akwụ na-egbo. Trump na-onwe ya kwuru na ya bụ okụ akpọrọ ya ""gosiri a gam n'ihu"" mana sikwe ọnwụ na ya agaghị eweli mmapụ ahu mapụrụ obodo ahụ ruo mgbe ahuru isi ya bụ okwu." afirika-43901680,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43901680,Ọnwụnwa ọzọ abịarala Dino?,Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijiria bụ INEC n'aha ịchafụ ebidola usoro iji wepu Sineto Dino Melaye n'oche ọchịchị n'obodo ya bụ Kogi.,INEC na enyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo Kogi West dịka iwu si kwuo Onye na-anọchite anya INEC na Kogi steeti bụ Ọkachamara James Apam kwuputara nke a taa ebe ha bidoro ị nyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo ya. Cheta na ụlọikpe enyebula INEC ikike ị ga niru were bido nwepu a a ga-eme Melaye ga-ebido n'ezie n'ụbochi satọday na-abịa. Dino Melaye bụ sinetọ ndị uweojii na-agba mgbo ị nwuchi ka ọ zaa ajụjụ maka okwu ụgha ọ gwara ndị uweojii na ndị omekome wakporo ụgbọala ya. Ndị ụlọọrụ sineti sọnyere osote onyeisioche ha bụ Bala Na'Allah ị ga leta Dino Melaye ebe ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ. Akụkọ kwuru na ọ merụrụ ahụ ebe ọ na-achọ ị gbapụ ọsọ nwere onwe ya n'aka ndị uweojii mgbe ha kpụ ya a ga ụlọ mkpọrọ. Melaye ebe ebu ya aga ụlọọgwụ Minista ochie Naịjirịa bụ Femi Fani-Kayode akatọla emume Melaye na-eme n'elu igwe okwu soshal midia: Akụkọ ga-amasị gị: afirika-47910830,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47910830,Nneka: 'Nwoke ọbụla hụrụ m n'anya ji m ụgwọ',Soshal midia enwurula ọkụ maka okwu otu nwata nwaanyị kwuru gbasara ụmụnwoke.,"""Nneka"" ka o si nye aha ya n'elu igwe okwu Twitter, sị na ""nwoke ọbụla hụrụ m n'anya ji m ụgwọ"" End of Twitter post, 1 O kwukwara na ọ chọrọ ịbụ nwaanyị ga-anọ n'ụlọ na-elekọta di ya na ezinaụlọ ya. Mana okwu ya ebidola mkparịtaụka n'etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị n'ihe metụtara oriakụ na odoziakụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Collins sị na ọ bụ ụmụagbọghọ ndị Igbo na-akpa ụdịrị agwa a. Enekem sị na ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa niile na-eche echiche ka Nneka. Oma kwuru na ụmụnwoke na-achọ ụgwọ nke ha n'ụzọ pụrụiche. Henry sị na ọ bụrụ na o mefuo ego n'isi nwaanyị, na nwaanyị ahụ eburula nke ya. Ebe Amarachi na-ekwu na onweghi onye ji ibe ya ụgwọ, ma nwoke ma nwaanyị. Ọtụtụ mmadụ ka jisi ke etinye ọnụ n'okwu a ugbua mana gịnị bụ uche nke gị? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-43719914,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43719914,Ndị uweojii egosila egbe ndị Imo Steeti wepụtara,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Lee ihe Kingsley Moghalu kwuru maka Buhari ịputa ọzọ,"Kingsley Moghalu bụ onye okaiwu bụrụkwa osoteonyeisi nke ụlọakụ kacha elụ na Naịjirịa n'afọ 2009 - 2014. Nwafọ Igbo bụ Prof. Kingsley Moghalu nke na-achọ ịpụta ịzọ ọchịchị onyeisiala ekwuola uche ya maka nkwupụta onyeisiala Buhari. Moghalụ kwuru na ihe ejiri mara onyeisiala Buhari bụ ụbịam na enweghị nchekwa. Ọ sịrị na ya ga-eme karịa. Ndị uweojii n'Imo steeti egosila egbe ha napụtara n'Imo Steeti Ndị uweojii bidoro inapụta egbe na Naịjirịa na 21 Feb. 2018 Onyeisi ndị ụweojii n'Imo steeti bụ Chris Ejike ekpopụtala egbe ndị mmadụ wepụtara na mmezu ị dọ aka na ntị ha nyere. Ejike gosiri ọha egbe dị otu narị na iri isii na asatọ (168) na mmgbọ karịrị puku abụọ n'Owerri na ụtụtụ a. Lee ihe ekwuru maka mmadụ itoolu ndị Naịjirịa egburu na London Egbuola ihe ruru mmadụ iri ise nke itolu n'ime ha bụ ndị Naịjirịa na Lọndọn kemgbe jenuwari Abike Dabiri-Erewa bụ oje ozị onyeisiala Buharị na mba ọzọ rịọrọ arịrịọ a ma degara ndị gọọmentị mba Lọndọn akwụkwọ. Ọ gwara ha ka ha tinye anya na nyocha mmadụ itoolu ndị Naịjiria so na ndị egburu n'obodo ahụ. Onye Afrịka ọzọ eritela ọla edo n'egwuruegwu Commonwealth Ndị egwuruegwu 37 na ndị isi 4 ka Naịjirịa dugara egwuruegwu kọmọnwelt N'egwuruegwu, nwafọ Botswana bụ Isaac Makwala esorola na ndị ritere ọlaedo n'egwuruegwu commonwealth. Oritere ya bụ ọlaedo na ọsọ nke mita narị anọ ha gbara. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Ikpe ikpe gawa godu'" 53249403,https://www.bbc.com/igbo/53249403,Oji River Killing: 'Anyị ka na-eche ikpe ziri ezi n'isi Nwoke a e gburu,Ndị obodo Amamkpunatọ dị n'Oji River nke Enugwu Steeti sị ha ka na-eche ikpe ziri ezi n'ogbugbu Eugene Iloabani.,"Ndị na-eme ngagharị iwe maka ogbugbu e gburu Eugene Iloabani, onye mụrụ nwoke anọ na nwaanyị anọ tupu ọ hapụ ụwa a. Onyeisi ọgbakọ obodo a bụ Ofor Chika Eze gwara BBC Igbo sị na ha anụbeghi n'ọnụ ndị uweojii etu nyocha maka ogbugbu Iloabani si aga. Ọ sị na e kwuburu na anwụchiri otu onye mana ha amaghị ma ọ bụ eziokwu dịka onweghi mgbe a kpọrọ ha bịa hụ onye ọ bụ. Ọ gara n'ihu sị na ọ bụ ha ji aka ha eche nche ugbua n'obodo ha kama na ndị uweojii na-abịa mgbe ụfọdụ ma gbagharịa n'obodo. Oji River Killing: 'Ndị ọchịehi anapụla m okpu eze' Eze sị na ndị obodo ha kpebiri na ha achọghịzi ndị ọchị ehi n'obodo ha maka na ehi ha na-ebe ihe akụrụ n'ugbo. Mgbe a jụrụ ya ihe gọọmentị Enugwu merela maka ọnwụ Iloabani na ọnọdụ nchekwa, ọ sị na gọvaọ Ifeanyi Ugwuanyi kwere ezinaụlọ Iloabani nkwa. ""Gọvanọ Ugwuanyi sị na ọ ga-azụ ụmụaka ya n'ụlọakwụkwọ site n'inye ha ohere agụmaakwụkwọ n'efu."" Kama na anụbeghi ozi site n'aka gọvanọ kamgbe ahụ, na ha chọrọ ị ga jụọ ya maka nke a. E liri ozu Eugene Iloabani onye a na-eche na ndị ọchị ehi gburu na Tọzde ụbọchị 9 nke ọnwa Julaị, 2020. Mana ọnụ na-ekwuru uweojii Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe ekweghi na o nwere onye ndị uweojii nwuchiri, kama ọ sị na nyocha ka na-aga n'ihu. Cheta na n'ụbọchị Tuzde ka ndị obodo Amamkpunatọ bu ozu Eugene Iloabani mee ngagharịiwe n'isiụlọrụ okpuruọchịchị Oji River, Enugwu steeti. Ha hụrụ ozu Iloabani n'ubi ya ebe ndị ekperima kere ya eriri ma gbuo ya. Dịka ndị uweojii siri kwuo, amabeghi onye maọbụ ndị gburu nwa amadị a, mana ndị obodo na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọchịehi Fulani gburu ya. Nwunye ya bụ Evelyn Iloabani kọrọ ka di ya siri gawa ọrụ ugbo n'isi ụtụtụ Monde Juune 29, 2020 ma ghara ịlọta na mgbede, mgbe ha jiri chọwa ya. Gee olu Toby Okechukwu maka ogbugbu a Oji River Killing: ""Gọomentị rụọ ọrụ nchekwa dịịrị ha"" - Toby Okechukwu O bu anyammiri n'isi kọwaara BBC ka ndị ha che na ọ bụ ndị ọchịehi siri gbuo di ya n'ugbo ya. Evelyn sị na ""ha kere ya eriri tupu ha egbuo ya n'ugbo ya. Mgbe anyị chọgara ya n'ugbo ya na mgbede, anyị hụrụ ndị ochịehi ebe ahụ. Mana ha gbapụrụ ọsọ mgbe ha hụrụ anyi"". Evelyn Iloabani na nwa ya nwoke Nwunye Eugene Iloabani, nwoke nwụrụ n'aka ndị e chere na ha bụ ndị ọchịehi n'Oji riva etiwala akụoyibo nsugbe. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọ kọwara n'uju etu o si chọpụta maka ọnwụ di ya nakwa etu obi si dị ya n'ihe onyonyo a: Ndị na-eme ngagharị iwe maka ogbugbu e gburu Eugene Iloabani, onye mụrụ nwoke anọ na nwaanyị anọ tupu ọ hapụ ụwa a. Lolo ndị obodo Amamkponato bụ Chinyere Gbugu bụ onye du ndị mere ya bụ ngagharịiwe kọwara ka ha si buru ozu Iloabani gaa ya mkpesa. O kwuru na ""ụmụokoroọbịa gara n'ugbo bụ ndị hụrụ ebe e gburu Iloabani, ma hụkwa ihe yiri mgbaaka ndị ọchịehi."" Lolo Gbugu sị na onyeisioche okpuruọchịchị Oji River bụ Frank Udemezie kwere ha nkwa na ya ga-eme ka Gọvanọ steeti ahụ mata maka ya bụ ọdachị dakwasara ha. Ndị omeiwu Enugwu steeti gakwara mgbaru na be ya bụ nwoke ka nke a mechara. Ndị omeiwu Enugwu steeti gara mgbaru na be Iloabani ụnyaahụ Ndị bịara mgbaru na be Iloabani Lolo Chinyere Gbugu sị na ihe dịka izuụka abụọ gara aga ka ha nụrụ kepukepu na ndị ọchịehi ga-awakpo obodo ha, mana ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ndị uweojii Enugwu steeti e biputalarị akwụkwọ ozi na-akatọ ya bụ ajọ agwa, ma na-eti aka n'obi na ha ga-ejideriri ndị mere arụ. Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu tiri aka n'obi na ya ga-achọtalata ndị mere ịhe a Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ A. Abdurruhman na-arịọ ndị Oji River ka ha dere juu ma ghara ịme ihe ọbụla ga-emebi nchọpụta ha na-eme. Onyeisi ndị Miyeti Allah n'Enugwu bụ Alhaji Haruna sị na ha anụbeghị maka ya bụ ihe mere n'Oji River. E mekwara ngagharịiwe maka ọnwụ Iloabani taa n'Ọkpara Square, Enugwu. Ndị mere ya bụ ngagharịiwe gụpụtachara ebe ụdị ihe ahụ mere n'Enugwu steeti ma na-akpọkụ gọọmentị ka ha bịa rụọ ọrụ nchekwa ha maọbụ ha e nwere aka ha chekwaa onye ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" mba-uba-53956525,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-53956525,Chadwick Boseman: Cancer egbuola onye mere ejije Black Panther,Ezinaụlọ ome ejije si mba Amerịka aha ya bụ Chadwick Boseman ekwuola na ọ nwụọla site n'ọrịa cancer.,"Boseman had not spoken publicly about his diagnosis Maazị Boseman dị afọ 43 tupu ọ laa mụọ. Ọ bụ otu n'ime ejije Black Panther o mere ka e ji mara Maazị Boseman karịa. Nwamadị a ekwughi maka ihe ọ na-agabiga n'ezi tupu ọnwụ ezute ya. Ezinaụlọ Boseman sị: ""Ezigbote onye agha, Chadwick diri ihe niile, ma wetere unu ihe ejiji unu bịara hụ n'anya ọfụma."" Ha kọwara na Boseman mere ejije dị ka ""rom Marshall, Da 5 Bloods, August Wilson's Ma Rainey's Black Bottom"" na ndị ọzọ ka ọ na-anata ọgwụgwọ banyere cancer a. Boseman bu ụzọ sepute isi mgbe o mere ejije a kpọrọ 42 n'afọ 2013 nakwa ejije a kpọrọ Get on Up n'afọ 2014, mana ọ bụ Black Panther ka a ga-eji cheta ya karịa. Kedụ ụdị Kansa gburu nwa amadị a? Ọrịa gburu Boseman bụ nke Bekee na-akpọ, bụ nke gunyere kansa niile na-eme n'ime eriri afọ. Aha a na-akpọ ọrịa na-esi ebe ọ na-eme mmadụ. Bkee na-akpọ ụfọdụ ""bowel cancer"" nakwa ""rectal cancer"" nke na-egosi ebe ọ na-eme onye ahụ. Ọ bụ ""bowel cancer"" ka a kacha afụ na mba Briten. Ọkankụ ndị a na-ahụ ọrịa n'ahụ agageela afọ 60. Lee akụkọ na-ekwu maka ọtụtụ ọrịa na-emekarị ụmụ nwoke: Ọrịa isii kacha emetụ ụmụnwoke karịa ụmụnwaanyị" afirika-43417843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43417843,Akwa adaala na Miami,Otu akwa di na mahadum akpọrọ Florida International University na bekee nke mba Amerike adaala.,Ugbua ha na-achọ ị zopụta ndị nọ n'okpuru ya Akụkọ na-ekwu na akwa nke a dakwasịrị mmadụ ole na ole mana ọnụọgụgụ nke ezie apụtabeghị. Ndị ọrụ nzọpụta na-arụ ọrụ ugbu a ịzọpụta ndị na no-okpuru akwa a. Ha na-arịọ ndị mmadụ ka ha sị okporo ụzọ ọzọ na-aga ebe ha na-aga. Ọ bụ ndị ụmụakwụkwọ na-aga mahadum Florida bụ ndị riọ arịrịọ ka ha rụọ akwa nke a maka n'ime ọnwa ọgọstụ n'afọ 2017 otu nwaakwụkwọ ibe ha nwuru mgbe ọ na-achọ ị gafe ụzọ a. Akụkọ ka nna-abia. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-44608283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44608283,"Ụlọoriri dị na Lagos etiela onye ntaakụkọ BBC ihe, kpachie ngwaọrụ ya",Nke a na-abịa site n'ihe mere n'abalị ụnyaahụ ka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọoriri na nkwari Blue Ivy dị na Legọs wakporo onye ntaakụkọ BBC Igbo.,"Nke a ga-eme ya ugboro abụọ a na-awakpo onye ntaakụkọ BBC Igbo Chris Okereke bụ onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ ịgba Godwin Opara bụ otiegwu a ma ama dịka 'Kabaka' ajụjụọnụ, oge ndị na-arụ ebe ahụ wakporo ya, tie ya ihe ma kpachie ngwaọrụ niile o ji gaa. Onye na-ahaziri Kabaka ihe bụ Solomon Chidubem na BBC Igbo nwere nkwekọrịta na ha ga-abịa ịgba ya ajụjụọnụ ebe ọ ga-anọ tie egwu n'ụlọoriri ahụ. Nke a bụ ugboro atọ ụdịrị ihe a na-eme onye ntaakụkọ BBC n'ime ihe na-erughị ọnwa anọ. BBC na-ekwu ka mwakpo a na-eme ndị ọrụ ya kwụsị, ma na-ekwu ka ndị na-ebuso ndị ntaakụkọ agha taa ahụhụ dị na ya. Dịka onye ntaakụkọ BBC siri kwuo, oge o rutere n'ụlọoriri ahụ, otu nwoke ọ na-amaghị gwara ya na ọ gaghị agbanwu Kabaka ajụjụ ọnụ ruo oge ọ ga-eticha egwu ọ bịara iti. Okereke kwuru na ọ tụgharịrị ka ọ lawa mana Chidubem kpọrọ ya n'ekwentị, gwa ya na ọ na-enye ya nkeji ise ka o ji gbaa ajụjụọnụ a. Okereke kwuru ""Kabaka kpọgara m n'ọnụụlọ ya maka ịgba ajụjụ ọnụ a, mana ka m chọrọ ịgba ya ajụjụọnụ nke ikpeazụ, otu nwoke gbabatara n'ime ọnụụlọ ahụ bido iti m ihe. Ọ nọ na-eti mkpụ na ọ gwara m agbala Kabaka ajụjụ ọnụ, ọ mara m ezigbo ụra n'ihu mana maka ejim kamera m, enweghị m ike ikpuchite onwe m. Ọ kụrụ m ihe tinka kụrụ pan ma ndị 'bouncer' ya tinyekwara aka tie m ihe."" Okereke sere foto ihe a ka ọ mechara Okereke kwuru na ndị ụlọoriri ahụ tiri ya ihe ma kwapụ ya n'ezi, mana o nwere ohere bute kamera ya na-ebutenwughị ngwaọrụ ndị ọzọ, bunye ya Chidubem ka o bunye onye ụgbọala Taxify na-eche ya. ""Ọkwọ ụgbọala ahụ chọrọ ịnyapụ mana ha kwụsịrị ya ma kpachie ụgbọala ya na ihe dị ya n'ime. Ụgbọala ahụ na ngwaọrụ ahụ ka nọ n'ụlọoriri ahụ,"" Okereke tinyekwuru. Ọkwọ ụgbọala ahụ gbara ọsọndụ ya. BBC na Kabaka kwuru, ebe ọ gwara anyị na n'agbanyeghị biko niile ọ rịọrọ, ha kụrụla Okereke gawa. ""Anyị na-achọ ịgba na ịza ajụjụọnụ oge otu nwoke batara, ghasasịa anyị ma bido iti onye ntaakụkọ ihe. E bidoro m rịọwa ya arịrịọ mana ọ nọ na-achọ iti onye ọbụla nọ ebe ahụ ihe."" Mgbe BBC kpọtụrụ ụlọoriri ahụ, ndị na-arụ ebe ahụ kwuru na Okereke ji otiegwu ha kwụrụ ụgwọ eji, na-agba ya ajụjụọnụ na-anataghị ha ikike. Otu onye na-arụ n'ụlọoriri ahụ jụrụ ikwupute aha ya gọrọ agọ na awakpoghị Okereke ma kpachie ngwaọrụ BBC. Mana, onyeisioche ụlọọrụ kpọtara Kabaka Legọs bụ Nicholas Orji, kwuru na ndị ụlọoriri ahụ gwara ya na ha kpachiri ngwaọrụ BBC maka na onye ntaakụkọ ahụ gbochiri otiegwu ahụ ime ihe ha kpọtara ya ka o mee. E kpesala akụkọ a n'aka ndị uweojii Legọs. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43388963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43388963,Ghana: Ndị LGBT si ka emere ntuliaka gbasara mmekọ ha,Otu LGBT na Ghana akpọkuola ndị omee iwu mba ahụ ka ha mee ntuliaka nye ụmụ Ghana ohere ikwu okwu gbasara ndị na-enwe mmekọ n'etiti ndị dị ka ha.,"Philcollins Agbedanu Kröger bụ onye nkwuchite ọnụ ndị LGBT na Ghana Ha kwuru na nke a bụ iji gosi ha na ezie, e nwere ụdị ndị a na mba ahụ. Onye na-ekwuchiteọnụ ndị LGBT na Ghana Onye nkwuchiteọnụ ndị LGBT na Ghana kwuru na ndị na-enwe ụdị mmekọ a na Ghana juru ebe niile mana ha enweghi ike ịpụta maka ụjọ na-eso mkpagbu ndị mmadụ na-enye ha maka ụka maọbụ omenaala. N'okwu ya : ""Okwu gbasara ime ka mmekọ nwoke nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị abụghị okwu otu onye, ka ha kpaa ya n'ụlọ omeeiwu nye anyị ohere ime ntuliak gbasara ya"", ọ gwara BBC Pidgin. Otu LGBT bụ ndị na-enwe mmekọ nime onwe ha Onye na-anọchite anya mba US na Ghana bụ Rober P Jackson nime ngwụcha izuụka gara aga kwuru ka ọnụọgụgụ ndị LGBT na Ghana karịrị etu ndị mmadụ si eche. O kwukwara na Ghana nwere ike ime iwu ikwado her tupu afọ iri na-abị mana na Naịjirịa, oney ọbụla ejidere na-enwe ụdị mmekọ a, ga-aga nga afọ iri na anọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42844043,https://www.bbc.com/igbo/42844043,Ihe ise ị ga-eme iji chekwa onwe gi ma ị nọrụ n'ime Taxi,Okwu na-ewu n'elu igwe okwu siri n'otu nwata nwanyi etipụla mkpụ maka mwakpo onye n'anya ụgbọala chọrọ ị wakpo ya.,"Oke mwakpo adị la n'elụ igwe okwu eji achọta ụgbọala Nke a bụtere arụmụka n'elu igwe okwu ebe ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ụdị ihe a na-eme. Anyị na ndị abụọ ọnụ n'eru n'okwu gbasara nchekwa nwere nkata were wepụta ụzọ ise ị ga-ejị were chekwa onwe gị iji gbochi mwakpo n'ịme ụgbọala. Kwụsị ị ga-ebe ọbụla na onwe gị Ike dị na mmekọ mmadụ n'ibe ya Ndị okachamara na okwu nchekwa gwara BBC na ihe na-egbochikari mwakpo bụ ma ndị mmadụ nọkọrita na-eme njem. Ọ bụru na ị nweghị onye gị na ya ga-eso ọ dị kwa mma ka ị gwa ndị ezin'ụlọ gị maọbụ ndị enyi gị. Saa anya gi Dịri nkwadọ, saa anya gị maka .ịhe mberede Tupu ịbanye ụgbọala ahụ ị nwere ike ịkpọ mmadụ gwa ha n'iru onye n'anya ụgbọala ahụ kọwara ha otu ụgbọala ha dị. Mara ụzọ ebe ị na-aga Onye mara ụzọ ọ gaghị efu Ọbụrụ na ịmaghị ụzọ, ọ ga-adịrị onye chọrọ ịwakpo gị mfe ịme uche ya. Muru anya dịrị njịkere Ekwena ka oke ụra n'apụ gị ịhe na ndụ gị Ụra dịnma na-ahụ mana ị rahụ ụra n'ịme ụgbọala taxi ga-enye onye ọ bụla chọrọ ịwakpo gi ohere iji mee ya. Akwụsị la ebe ọbụla ọkụ adịghị Onweghị ihe ọjọọ pụrụ ime n'ịhe Ọ dị mfe ịwakpo mmadụ n'ebe ọkụ adịghị nya mere ị ga-eji diri nche maka ebe gbara ọchịchịrị. Ndị ọnụ n'eru n'okwu na ihe gbasara nchekwa nwekwara ndụmọdụ ha nyere ndị na-anya ụgbọala taxi. Ha sị ha gaa ịbụte mmadụ, ha dịrị nkwucha gaa ọsọ ọsọ n'ebe ha nwere ike ikọwa dịka ụlọ obibi maọbụ ụlọ ọrụ maọbụ ụlọ akwukwo iji gbochi ndị ohi ịwakpo ha." afirika-46714377,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46714377,#WalkofWomen: Etu Oby Ezekwesili si chụ nta vootu n'Anambara,Oby Ezekwesili gwara ndị Anambra steeti na obi dị ya ụtọ etu ha si nabata ya n'etiti ha.,"Ezekwesili kwuru na oi dị ya ụtọ ka o si enwekorịta mkparịtaụka n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ O jikwa ohere ahụ were kwuputere ha ka ọ ga-esi mee ka ndụ dịrị ha mma ma ọ banye oche ọnyeisiala n'afọ 2019. End of Twitter post, 1 Ezekwesili bidoro atụmaatụ akpọrọ ""#walkofwomen"" iji wee mee ka ụmụ Naịjirịa ghọta mkpa ọ dị ịgbapụta Naịjirịa n'aka ndị nọ ọchịchị ugbua na ntuliaka 2019. O buru ya bụ atụmaatụ gawa Onicha ma bie ije na All Saints Primary School Onichaa. Oby gwara ụmụ Naịjirịa ha tunyerela Atiku na Buhari na ntuliaka na-abịanụ Oby kwuru na njem a dị ya ezigbo mkpa makana o na-enye ya ohere ịmata ụmụ Naịjirịa ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43506089,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43506089,Nsogbu Cambridge Analytica: Njọ ọ dị na social media?,"Ọ bụrụ na ị na-ege ntị ihe na-eme ugbua, i ga-anụla otu ụlọorụ a kpọrọ 'Cambridge Analytica' si na-anata ozi gbasara ọtụtụ mmadụ maka ntụliaka.","Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa Mana ihe mere okwu sị nwe ka o sịrị dị a na nwerị ozi a n'elu social media dịka Facebook. Onyeisi ndị Facebook bụ Mark Zuckberg na-arịọ arịrịọ na ọ bụ eziokwu na Cambridge Analytica bia websait ha narị ozi a. O kwukwara na ọ ga-agba mbọ hụ na ụdị ihe a anaghị eme ọzọ. Ihe dịka mmadụ nde mmadụ iri ise ka ndị a nara ozi gbasara ha mana ọ dị ka ọnụọgụgụ ha karịrị nke a. Ka ọ sị gbasara gị Mark Zuckberg na-arịọ arịrịọ Facebook nwere mmadụ ruru ijeri abụọ na mba ụwa n'elu websait ha, ngịnwa so na ha. Ọtụtụ oge, ị ga-ejị ọsịsọ pia 'oo' maọbụ 'ekwe m' mgbe ị chọrọ ị nata app ha maọbụ ị hụ ihe a kpọrọ 'Terms and Condition' na bekee mana ị naghị a gụọ ihe a dere ọfụma ka ị chọpụta ihe ụlọọrụ a ji ozi nke a eme. Ụfọdụ mmadụ kwuru na akwụkwọ ozi a toro ogologo, ma dị kịrịkịrị n'anya. Ebe ọ bụ na onweghị ihe ọjọọ mere ndị ọzọ, onweghị ihe ọjọ ga-eme gị. Ọ bụghị etu a. Ka o si bụrụ na ị ga-aza ajụjụ nlele dịka; 'Kedụ nrị dị gị mma n'ahụ?' Maọbụ kedụ otu ndọrọndọrọ ị na-enye nkwado? Ha ga-enye kwa gị azịza ụfọdụ. Ụfọdụ oge, ha ga-enweta ya, ụfọdụ oge anaghị enweta ya, onye maa ebe azịza niile na-aga Onweghị Ka osị metụta Naịjịrịa Ọtụtụ ndị ala Naijiria nọ na Facebook SCL nwere ụlọọrụ Cambridge Analytica tinyere aka na ntụlịaka ala Naịjirịa nke afọ 2015. Otu akụkọ sị ụlọọrụ ntaakụkọ Guardian kwuru na otu onye Naịjịria bụ nnukwu mmadụ nyere Cambridge Analytica ọrụ ijeri naira ka ha gba mbọ hụ na Goodluck Jonathan laghachiri n'ọkwa ọchịchị. Akụkọ a kwuru na nwoke a nyere ha ego ruru nde dọla abụọ na asatọ maka ịgbasa ozi ga-emebi ọsọ ịzọ ọchịchị nke Mohammadu Buhari. Akụkọ kwukwara na Cambridge Analytica banyere n'ime imale nke Buhari. Nsogbu a emetụtaghị sọ ala Naịjirịa Uhuru Kenyatta onye isi ala Kenya N' ala ndị ozọ dịka Kenya, Cambridge Analytica kwuru na ha rụrụ ọrụ n' afọ 2013 na 2017. Ọtụtụ mmadụ hụrụ na ntụlịaka ala Kenya mere n'afọ 2017 nwere ọtụtụ ozi asị sị Facebook na Whatsapp pụta." afirika-49911397,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49911397,Enugu Airport Closure: Mmechi ọdọụgbọelụ akụọlara ndịọrụ ọrụ,Ndịọrụ ụgbọelu na-arụ n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibiam dị n'Enugwu na-akpọkụ gọomenti etiti ka ha mee ngwangwa ịrụzi ya bụ ọdọugbelu e mechiri kamgbe ọnwa Ọgọstụ afọ a.,"Ndị a BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ndị niile na-akpata ihe ha na ezinụlọ ha na-eri n'ọdọụgbụelụ ahụ tipịara etipịa ugbua. Agu Joseph bụ onye ọrụ Arik Airline sị na ihe na-efulahụ ha maka ya bụ mmechi karịrị akarị. Ọ sị na ego kwesiri ịbatara ụlọorụ ahụ sịte na ndị na-aga Enugwu anaghịzị abata. Joseph kwuru na a bụghị ya ka ọ dịịrị ikwu ego ole na-efulahụ ụlọọrụ ha maka ya bụ mmechi. Onye ọzọ na-arụrụ Azman Air ọrụ bụ Benjamin Aluya Agboga sị na mmechị ya bụ ọdọụgbụelụ tinyere ha na nnukwu gbagharịa. Agboga kwuru na ha na-agazị Asaba nakwa Owere iji gotere ndị ahịa ha akwụkwọ eji agba ụgbọelu. Ọ sị na ahụhụ dị na ya karịrị akarị nke bụ na ihe na abatara aha erughị ka ahụhụ ha na-ata. Agboga kwurukwara na-agbanyeghị na e kwere ha nkwa na a ga-arụcha ya bụ ọrụ n'ọnwa Disemba, mana ọrụ amalitebeghị ebe ahụ nke taa. Mmadụ abụọ a kwetekwara na ọ ka mma imechi ya bụ ọdọụgbụelụ karịa na a hapụrụ ya ka ọ meruo mmadụ ahụ. Kama ha rịọrịọ gọọmenti etiti ka ha bịa mezie ya bụ ọdọụgbọelu dịka ha kwere na nkwa. Akụkọ ga-amasị gị: Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?" afirika-45041618,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041618,Zimbabwe: UN etinyerela ọnụ n'ọgbaghara malitela na Harare maka ntuliaka,"Ngalaba jịkọ mbaụwa bụ United Nations (UN), mba Briten na mba Amerịka etinyere ọnụ n'ọgbaghara na-eme na mba Zimbabwe.","BBC captures footage of post-election violence in Harare Onyeisi Yun bụ Antonio Guterres rịọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Zimbabwe ka ha kpachara anya, ka onye na-ahụ maka ihe metụtara mba ofesi na Briten bụ Harriet Baldwin si na ọgbaghara a na-emetụta ya n'obi nke ukwuu. End of Twitter post, 1 Ọgbaghara dara n'etiti ndị nchekwa obodo na ndị na kwado Nelson Chamisa bụ onye na-azọ oche onyeisiala mba Zimbabwe ka emechara ntuliaka n'ụbọchị Monde. Morgan Tsvangirai nke Zimbabwe anwụọla Ndị zuru ego Zimbabwe eweghachila ya Ọkwa ọnwụ: Morgan Tsvangirai Mmadụ atọ nwụrụ n'ọgbaghara bidoro mgbe ndị na-akwado otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Movement for Democratic Change (MDC) kwuru na pati na-achị ugbua bụ ZANU-PF ghọrọ aghụghọ na ntuliaka ahụ. Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru na ZANU-PF meriri ntuliaka nke eji hụpụta ndị omeiwu, nke mere ndị na-akwado MDC jiri bido ngagharị iwe na Harare, isi obodo Zimbabwe. Gọọmentị Zimbabwe mechara zipu ndịagha na ndị uweojii ịhụ na ọghaghara ahụ kwụsịrị. Onye na-ekwuchite ọnụ Chamisa katọrọ ogbugbu mmadụ ato ahụ ma kwuo na ""onweghị ihe a ga-eji kọwa mmekpa ahụ"" nke ya hụrụ. ""A na-akụzịrị ndịagha igbu mmadụ ma a na-anụ agha. Ndị nkịtị ha abụzị ndị iro?"" Ndị agha gbara egbe iji chụsaa ndị na-eme ngagharị iwe Akpọbeghị aha onye meriri ntuliaka nke onyeisiala, mana ndị MDC na-esi ọnwụ na Chamisa meriri onyeisiala Emmerson Mnangagwa. Nke a bụ ntuliaka mbụ ndị Zimabawe na-eme kemgbe achụtụrụ Robert Mugabe n'ọchịchị." 42915119,https://www.bbc.com/igbo/42915119,Ọrịa Kansa akpamamịrị egbuola karịa kansa ara,Ọnụọgụgụ ụmụnwoke na-anwụ site n'ọrịa kansa akpamamịrị akarịala ọnụogụgụ ụmụnwaanyị na-anwụ site n'ọrịa kansa ara dịka nchọpụta siri kwuo na mba UK.,"kansa akpamamịr na-aka egosi oge ụmụnwọke ruru afọ iri anọ Ụmụnwoke na-aka nka pụtakwara na ọtụtụ ka na-enweta mana anwụ site n'ọrịa ahụ. Ndị nyocha gbasara ọrịa kansa nọ na mba UK kwuru na nchọpụta na ọgwugwọ a na-eme maka kansa ara na-amịta mkpụrụ ebe itinye ego gbasara kansa akpamamịrị umụnwoke ga-enyekwa aka. Nchọpụta ọnụọgụgụ pụtara site n'afọ 2015 gosiri na mmadụ 11,819 nwụrụ site na ọrịa kansa akpamamịrị ebe mmadụ 11,442 nwụrụ site na ọrịa kansa ara. Kansa akpamamịrị kachasị n'ụmụnwoke nọ na UK Ndị ọrụahụike ekwuola na nchọpụta n'oge kachasị mkpa iji gwọ akpụ kansa. BBC Igbo gbara Dọkịnta akpọrọ Remi Ajekigbe ajụjụ ọnụ,o kwuru na ọrịa kansa ara ka egbu karịa ọrịa kansa akapamamịrị na Naijirịa. O kwukwara na ebe nsogbu na dịkari bụ na ụmụnwoke anaghị bia nyocha ahụ n'oge.Ha na bia mgbe ihe ọ ka njọ. ""A na-agagharị na-akuziri ndị mmadụ n'ulọ akwukwọ,chọọchị,ulọakụ na ebe ndị ọzọ maka ọria Kansa nakwa ka esi egbochi ya"". Emume ndị a ka a ga-eji nabata ụbọchị nrụbama ibuso agha ọrịa kansa bụ Februwarị anọ." afirika-43130440,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43130440,"Di na nwunye erela nwa ọhụrụ ha n'ọnụ ego naira 400,000",Ngalaba na-ahụ maka nyocha mpụ n'ụlọ ọru ndị uweojii n'Imo steeti a nwuchiela di na nwunye akụkọ kwuru na ha rere nwa ha Chinecherem,"A zọpụtara Chinecherem n'ọnwa Febrụwarị n'ụbọchị iri na asaa. n'ọnụ ego naira nari puku anọ (400,000),ka ọmụchara nwa ọhụrụ. Dị na nwunye a bụ Ifeanyi, iri ato na ise, na Emmaculata Elijah dị iri atọ bụcha ndị Amakpụ -Umuba, n'Isiala Ngwa North n'okpuru ọchichi dị n'Abia steeti. Mana ha bị na Irete, na Owerri West n'okpuru ọchịchị Imo steeti. Ndị ọzọ a na-enyocha sonyere na mpụ a bụ Grace dị iri ise na ise onye Ụmụọba Ụratta n'okpuru ọchichị Owerri North, Fedalia dị iri ise na ise bụkwa onye Umụoba Ụratta nakwa Amarachi dị iri anọ na itoolu onye sina n'okpuru ọchịchị Ideato North. Onye na-ekwuchitere ndi uweojii ọnụ na Owerri bụ Andrew enwerem kwuru na di na nwunye tụkọtara alo na ntabị anya eji mụcha nwa ha nwaanyị were resi ya obiekwe site n'aka Mezu na Ariri. Enwerem onye kwuputere na di na nwunye a amụọla ụm̀ụ asaa,siri na amaghị ebe ụmụ abụọ n'ime ha nọ. O kwuru na onye isi ndi police n'Imo steeti nyere iwu ka a ma ha ikpe ma enyochasia mpụ a. Enwerem sị na nwa ọhụrụ ahụ enwetaghị ihụnanya na nlekọta nne na nna ka amụchara ya. Di na nwunye kpakọtara nkata ka ha nara Naira 400,000 karia ma i nara nwa ha nwaanyi. Ọ dị ka ihe nkiri mgbe ha nọ na-adọ ndorọndọrọ onye mere mpụ a. Ufọdụ n'ime sị na ọ bụ nne nwa ahụ sonyere na mpu a mana ọ sị na aka ya adịghị ya. Nwaanyị goro nwa ọhuru ahụ gwara ndị nta akukọ na ọ nyere Ifeanyi na Emmaculata ego ahụ na be ha. Ifeanyi kwetere na ya na nwunye ya resiri Obiekwe nwa ha." afirika-43172824,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43172824,Izu Afrịka na foto: Site Febrụwarị 16 ruo 22 nke 2018,Nhọpụta foto kacha mma si na mpaghara Afrịka na nke ndị Afrịka nọ ebe ndị ọzọ n'ụwa n'izu a.,"Ọbụghị kwa ụbọchị ka ị ga-ahụ enyi kpodoro isi n'ala ma koro n'ikuku - mana n'ụbọchị Wenesde na obodo Nyeri county dị na Kenya, ihe a bụ ihe mere eme. Ọ bụ ndị mmadụ nọ na-efe efe n'Abidjan, Ivory Coast, ka a na-eme mmemme bekee kpọrọ circus nke mbụ ha. Na Zimbabwe, ndị mmadụ gbakọrọ iru uju maka ọnwụ onyeisi otu Movement for Democratic Change (MDC) bụ Morgan Tsvangirai, onye nwụrụ ka ọ dị afọ 65. N'otu ụbọchị ahụ, otu nne mụrụ nwa ya n'ụlọọgwụ dị na Juba, South Sudan. Obodo ahụ bụ otu n'ime ebe ndị kachasị njọ inọ mụọ nwa n'ụwa, dịka Unicef kwuputara n'izu a. N'Ethiopia, ndị agha lara ezumike nka mere ncheta ndị egbuchapụrụ n'Addis Ababa, oge ndị agha Italy bigidere ha gburu ndị Ethiopia ruru 20,000 n'ụbọchị 19 nke Febrụwarị, 1937. Ndị Libya chetakwara ụbọchị dị mkpa n'izu a. Ụbọchị 17 nke Febrụwarị, mere ya afọ asaa nke ọgbaaghara butere nchutu Col Muammar Gaddafi. Igafee oke, Egypt na-akwado maka ntuliaka. Ndị nkwado tinyere ọkọlọtọ mgbasa ozi maka onyeisiala ha na Cairo n'izu a. Saụt Afrịka enwebeghị ntuliaka, mana ha nwere onyeisiala ọhụrụ. Ahụrụ Cyril Ramaphosa ebe a tupu o mee nkwuputa gbasara ihe na-eme n'obodo nke bekee kpọrọ State of the Nation address. Ọ ga-amasị anyị ịma ihe nwaanyị a hụrụ ugbu a. N'akụkụ ụwa ọzọ na mba Saụt Korea, onye ọsọ skeleton si Ghana bụ Akwasi Frimpong nọ na-egosi nwa ya enyi ọhụrụ. Mana na Kenya, echiche na-abanye n'ime asọmpi nnukwu na-abịa - egwuregwu Commonwealth n'Australia n'Eperelụ. Ndị nwe foto a bụ AFP na EPA" afirika-51081947,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51081947,Aston Villa v Man City: Man City ejirila nkata bunye Villa goolu na be ha,Otu Manchester City emeghiri Aston Villa ebere dịka ha ji nkata kponye ha ọkpụ goolu isii.,"Villa gbalịrị ịnyeghachi ha mana ha gbanyere naanị otu ọkpụ na ngwụcha asọmpị ahụ. Mahrez nyere goolu abụọ mbụ na nkeji 18 na 24 ma Aguero so ya n'azụ site na nke o nyere na nkeji 28. Na oge etinyesoro n'agba nke mbụ, Gabriel Jesus nyere otu ọkpụ na nkeji 46. Dịka amalitere agba nke abụọ, Aguero nyekwara ọkpụ abụọ ọzọ na nkeji 57 nakwa 81. Ndị uweojii anwụchiela ụmụ nwoke na-ezu ọbante ụmụnwaanyị Ndị uweojii na Legọs anwụchiela ụmụ nwoke ise maka ị zuru ọbante ụmụ nwaanyị na gburgburu ebe ha bi n'Ọjọ. Otu n'ime ha bụ Chukwujaekwu EzeIgbo kwuru na o ruola otu afọ kemgbe ọ na-akpa mkpa mkpa a. Ndị ahụ a nwụchiri kwuru na ọ bụ ọgwụ ego ka ha ji ọbante ndị a agwọ. N'aka ọzọ Ndịagha Naịjirịa ekwuputaghị mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a Ndị agha Naịjirịa ekwuola na atụmatụ ha kpọrọ Handarin Daji ataala isi n dị ohi ruru otu narị na Zamfdara nakwa Katsina steeti. Ha kwuru na agbagburu ndị a n'ogige ebe ha na-ezo site n'ọnwa Disemba rue ọnwa Jenụwarị afọ a. Na mba ofesi, Di Queen attend church service for Sandringham on Sunday morning Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth akpọọla nzụkọ gbatagbata ezinaụlọ ya n'obieze Sandringham iji kpa maka okwu Ọkparaeze Harry na nwunye ya Meghan. Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka Harry na nwunye ya Meghan kwuru na ha ga-akwụsitụ ọrụ dịka ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị ma malite ịkpata ego nke ha. N'egwuregwu, Watford ejirila ọkpụ goolu atọ fọjuo otu Bournemouth ọnụ dịka Aston Villa na Man City na-akwata ya ugbua ịji ma mbe na abọ nke bụ oke n'asọmpị Premier Lig. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị nchekwa jichiri Rob Macaire ihe ruru awa atọ Ndị nchekwa Iran nwụchirị onye nnọchite anya mba Briten bụ Rob Macaire na ebubo na ọ chọrọ ibido ọgba aghara mgbe ọ biara ọgbakọ ịmu anya maka ndị nwụrụ n'ụgbọelu Iran gbaturu. Kama Macaire si na ọ bụ asị ma sị na ya apụọla tupu ọgbakọ ọha ahụ aghọrọ ngaghari iwe. O kwuru na ya gara ya bụ imu anya mgbaru maka n'ọbụ ihe ziri ezi ma tinye kwa na ụfodụ ndị nwụru bụ ndị mba Briten. Ndị mba briten gbarụrụ ihu ma sị na njichi ejichiri onye nnọchite anya ha megidere iwu ụwa niile n'ihi na ekwesighị inwụchi onye nnọchite anya obodo ọbụla. Ndị nchekwa Iran nwụchịrị ya ma jichie ya ihe ruru awa atọ. Cheta na Iran ka na-aza ụgba maka ụgbọelu ndị mba Ukraine ha ji ogbunigwe gbatuo. Maka ọnwụ Chukwuemeka Ike Ode akwúkwó dere 'Bottled Leopard' Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buahrị ezigarala ndị Anambra na ndị ezinaụlo ode Akwụkwọ bụ Chukwuemeka Ike ozi iti aka n'obi maka ọnwụ ya . Ọ bụ onye ndụmọdụ gọọmentị n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina depụtara nkea ma sị na ọnyeisiala bụ Buharị sị na a ga-echeta Chukwuemeka Ike maka ọrụ ya n'imepe obodo na-ihu na ndị ntotoobia nwetere ezigbo ọzụzụ. N'Ofesi Ụmụakwụkwọ mahadum Amir Kabir pụtara ikwanyere ndị nwụrụ n'ụgbọelu ahụ ụgwụ Otutu ndị mmadụ apụtala n'igwe ha n'isi obodo Iran bụ Tehran ime ngagharị iwe megide ndị ọrụ gọọmentị tubụrụ asị mgbe ha sị na ọbụghị ha gbaturu ụgboelu mba Ukraine. Ọ bụ na Mahadum abụọ ka emere ngagharị iwe a ebe onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwadoro ha ma sị na ngaghari iwe ha na akwalite mụọ. N'Egwuregwu, Serena Williams onye dị afọ iri atọ na asato ji merịa were mee ya mmerị asọmpị Tenịs nke iri asaa na atọ ya. Wlliams kwuru na ya ga-enye ego o ritere na mmeria na uwe oyi were zọo asọmpị ahu maka inyere aka maka ọkụ na-agba na mba Ustrelịa. Ọ ka apụtakwa n'ọgbọ dịka ya na Caroline Woziniacki ga-ezute Asia Muhammad na Taylor Townsend na agba nke ikpeazụ nke mmadụ abụọ. Jurgen Klopp sị na anya ha dị na iko Premiership Dịka ndị otu egwu bọọlu liverpool ji otu ọkpu goolu were merie ndi nke tottenham, onye ndụ ha bụ Jurgen Klopp na akowa na na-agbanyeghi na ha ji akara iri na isii were buru eze na Premiership, na ọ naghị aba ha anya tutu ha ebulie iko premiership." afirika-44767789,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44767789,Ndị ọrụ FRCN gbanyụrụ redio n'ụbọchị 9 Julaị,Ndị ọrụ Radio Nigeria Enugwu karịrị mmadụ otu narị emeela ngagharị iwe na gburugburu Enugwu iji gosi iwe ha.,"Ndị ọrụ na-akọwa na ha chọrọ nhazigharị ọnọdụ ha ji arụ ọrụ Ndị ọrụ ahụ niile yicha uwe ojii ma buru akwụkwọ edepụtara iwe ha. Ndị a na-arụ na ngalaba ""Federal Radio Corporation of Nigeria"" (FRCN) nyere gọọmentị izuụka abụọ igboro ha mkpa ha. Onyeisi ngalaba na-ahu maka ndị ọrụ a bụ RATTAWU nke FRCN Enugwu bụ Chris Agu, kwuru na ha gbara abụbọ ọrụ awa abụọ iji gosipụta nnukwu iwe dị ha n'obi. Ndị a na-eme ngaghari iwe Agu gụpụtara ihe ha na-ana gọọmentị dịka: Onye ọzọ sokwa chịkọba ha bụ Emeka Anyalebechi bụ onye na-anọchịte anya NUJ, kwuru na abụbọ ọrụ ahụ bụ nke ịdọ aka na ntị nke ụlọọrụ FRCN niile na Naijiria mere. Onye mgbasaozi Ndudi Chude, kwuru na ha enyela gọọmentị etiti ụbọchị iri na anọ iji gboo mkpa ha niile. Chude kwuru na ọ bụrụ na ha emeghị otua, ha ga-abagide abụbọ ọrụ nke nnukwu ya. Onye Zonal Director FRCN Enugwu bụ Ike Okere, kwere ndị ọrụ nkwa na ya ga-eburu ozi mkpa ha bugara gọọmentị site n'aka DG FRCN. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44861734,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44861734,Gịnị na-esere Charly Boy na Dewy Oputa nwa ya?,Charly Boy na nwa ya nwaanyị bụ Dewy Oputa na-agbagha onwe ha okwu n'elu soshal midia banyere ọnọdụ nwa ya dịka onye naanị nwaanyị ibe ya na-amasị nke Bekee kpọrọ 'Lesbian'.,"Ihe kpalitere okwu ahụ bụ na Charles Oputa, a ma dịka Charly Boy, jiri ihe ya na nwa ya jerela n'afọ anọ ọ chọpụtara na ọ bụ naanị nwaanyị na-amasị ya were dụọ ndị nne na nna ọdụ. Ya bụ okwu Charly Boy kwuru gbara nwa ya nwaanyị iwe, o wee katọọ nna ya sị na ọ bụ ""ọkaa mma n'ama'. End of Twitter post, 1 Mgbe BBC Igbo kpọrọ Charly Boy ịnụta olu ya banyere ihe nwa ya sara ya, o kwuru sị: ""Ihe mere o ji ekwu otu a bụ na ọ bụ ụmụaka."" O kwukwara na ọ dị ya ka ọ gbaala ya n'anwụ."" Charly Boy kwusiri ike mkpa ọ dị nne na nna ịnabata nwa ha torola ogo ihe e ji mmadụ eme ibi ndụ ha etu masịrị ha. Ihe bidoro ụka N'ozi Charly Boy depụtara na Facebook ya n'ụbọịchị Fraide, ọ gbara ama ka Naijiria siri dị ya ka Gana oge nwa ya nwaanyị bụ Dewy gbuwara ya akụoyibo Nsugbe na ya bụ nwanwaanyị ihe naanị nwaanyị na-amasị na etu ya sị nabata ya ka ogologo oge gachara. Ọ sị na "" Amaghị m ka ọbị m adị."" ""Ọtụtụ ihe gbatara m n'uche:'Kedụ ihe mere mejọọ?' 'Nwa m m che na m ma ma ahụnanya anọghịzịkwa ya',' ọ bụ na ndị mmadụ agaghị ebido kpapụwa nwa m?' ' Ọ bụ na nwa agaghị ebi n'ọkụ ala mụọ?'. O kwuru na dịka echiche ndị a na-aga njem n'ime obi ya, ya nọ na-atụ onwe ya mbọiji jide onwe ya aka. O kwuru na ihe a bịara ya dịka ọnwụwa n'ihi na onwe ole na ole tupu nwa ya a kpọrọ okwu aha, na ya na-ekwuchitere ndị mmasị ha bụ nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha. O kwuru na ịnabata ọnọdụ nwa ya bụrụ ya ""ịnabata eziokwu dịka ịwa afọ., Ọ na-afụ ụfụ mana ọ na-agwọ ọrịa. Asị dịka ọgwụ ahụ mkpu, ịṅụ ya, ei nweta onwe gị ozigbo mana ihe so ya na-adigide."" Ihe Dewy sara ya Mana okwu ahụ Charly Boy kusuru nwa ya nwaanyị onye kpọrọ okwu nna ya kwuru, ""mere mere n'ihu, gwọmpụtụ n'azụ"". Dewy sịrị na nke bụ eziokwu bụ na nna ya anaghị aza ekwentị ya ma ya fọkwa ya na ya ịdị na mma. O boro nna ya ebubo ịgbawa ya aka ego oge ọ lọtara na Naijiria nke na ọ bụ site na amara enyi ya ka ya jiri laghachị ala Bekee. Dewy kwuru sị: ""N'afọ 2017, a chụpụrụ m n'ụlọ, enweghịkwa m ebe obibi ma ewezụga enyị akara m ịhụ nri maọbụ ebe ndokwasa isi."" ""Ihe zọrọ bụ na e ji akwụkwọ njem ga-ebugachi Atlanta(Amerịka), alaghachiri m na-enweghị ego ọbụla ma ya fọdụ ebe m ga-ehi."" Charly Boy: Nwa ya nwaanyị na-ayị nwaanyị ibe ya nwere ike ime ihe masịrị ya Charly Boy ekwuola na dịka nna ya ebighịrị ya ndụ ya, na ya agaghị ebiri nwa ya nwannyị ndụ nke ya. Nwa Charly Boy nwaanyị bụ Dewy Oputa na-ewu na soshal midia maka nkwụpụta omere na ya na nwaanyị na anọkọ dịka nwoke na nwaanyị. Charly Boy gwara BBC Igbo n'elu ekwentị sị, ""Ama m maka ihe a kemgbe afọ atọ gara aga. ""Ọ bụghị ihe ọhụrụ, ndụ nwa m na-aga ọfụma."" ""Nna m ebighịrị m ndụ m, agaghị m ebiri nwa m nwaanyị ndụ ya."" Nwa ịkpeazụ bụ Dewy Oputa kwuru na egwu na-atụ ya mana ọ ga-eme ihe a, we kwuputa na ya na enyi ya nwaanyị emepeela peeji instagram nke ha. Ọ bụ akụkọ na-ewu ewu n'ihi na Naịjirịa manyere iwu na-ekwu na nwaanyị maọbụ nwoke ọbụla ya na ibe ya nwere mmekọ ahụ ga-aga ụlọmkpọrọ rue afọ iri na anọ." afirika-53740076,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53740076,Okwesilieze Nwodo: Ihe ga-emebi rinne ma ọ bụrụ na Ndigbo achịghị Naijirịa n'afọ 2023,"Onye chịbụrụ dịka Gọvanọ Enugwu steeti bụ Okwesilieze Nwodo ekwuola na ọ bụrụ na Ndigbo enwetaghị ohere ịbụ onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023, ""na ihe ga-emebi rinne.""","Okwesilieze Nwodo: Ọ bụrụ na-enyeghi onye Igbo ọkwa onyeisi Naịjirịa, ihe ga-emebi Nwodo kwuru na o meghị etu a, na ndị Okenye Igbo na-eji ndị ntorobia ha chọrọ nnwereonwe ka ha dereju, agaghị enwekwa ihe ha gbadoro ụkwụ iji si ha nwee ndidi na onye ọbụla ga-enweta oke ruru ya na Naijiria. Nwodo, onye kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka ụbọchị Tuzde kwuru na dị ntorobia Igbo na-ekwubu na ndị ọzọ agaghị ekwelata ka Igbo chia Naijiria ga-asị na ihe ha kwuru emezuola. O kwukwara na ndị agbụrụ ndị ọzọ obi adịghị mma n'ihe na-eme Naijiria ndị na-ekwu okwu ọpụpụ ga-ekwechiri ịpụ na Naijiria ma Igbo enwetaghị ohere ịchị n'afọ 2023. Nwodo tụrụ arịrị na naanị Igbo bụ otu n'ime alaka atọ Naijiria ji kwụrụ enwetabeghị ohere ịbụ onyeisiala. Ọ sịkwa, ""Anyị chọrọ Naijiria onye ọbụla nọ n'ime ya ga-enweta afọ ojuju mana ọ bụrụ nke a na-eme anyị ihe a na-eme Igbo kemgbe Agha biri, anyị ga-esokwa ndị ọzọ sị ka ahapụ Naijiria."" Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị ugbua o ruru Igbo ka a ga-ana-ekwu okwu onye tozuru dịka ọ kwuru na Igbo nwere ebu nwee ụfụ na ndị tozuru ịchị dịka onyeisiala. Nwodo kwuru ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na nkata ahụ, lee ụfọdụ n'ime ha: 1. Maka Nnamdi Kanu na-ọchịchọ Biafra Nwodo kwuru sị ""anyị bụ ndị okenye na-agwa Nnamdị Kanu na ọ bụrụ na anyị ga-enweta Bịafra, na ọ bụghị ịkparị ndị mmadụ ka anyị ga-eji enweta ya"". Nwodo kọwara na ụfọdụ ndị agbịrụ ndị ọzọ nwere ike iji okwu ọnụ Kanu megide ndị be anyị. Ndị Igbo ji ekwurekwu ebutere onwe ha nsogbu na Naịjirịa - Onyeisi Ohaneze Legọs Ọ kọwakwara na dịka o si na ha ga-esonye Nnamdị Kanu, na nke ahu apụtaghị na ha kwadoro maọbụ na ha ga-eso ya akparị ndi mmadụ. Ụzọ a ga-esi enweta Biafra na-alụghị ọgụ bụ ime ihe a na-akpọ 'plebiscite' n'okwu bekee ma sịkwa na ụzo ọzọ bụ ịju ndị mpaghara ma ha chọrọ ịpụ. Plebiscite bụ mgbe ndị mmadụ mere ntụliaka iji mara ma ha a ekwenyere ịsoro mba ọbụla maọbụ na ha achọghị. Kama enweghị iwu kwere na gọọmentị ga-eme ihe pụtara na ntụlịaka plebiscites. Nwodo kọwara sị, ""ebe anyị kpọ ụmụ Igbo na-aga, kedụ ihe anyị ga-eme ma ọ bụru na ndi ahụ achọghị anyị?"" O kwuru na ha na-arịo ndị agbataobi Ndigbo na ndị agbụrụ ndị ọzọ ka ha ""mee ndị etu e mere ibe ya"". O kwukwara sị, ""Ị gaghị akpọchị anyị na nga sị anyi ekwula okwu ma sịkwa anyị esola ndị na-ekwu okwu"". Nwodo kwuru a ndi niile hụrụ Naijirịa n'anya sị ka a hapu Ndigbo ka ha chịa. 2. Maka nhazigharị Naijiria Okwesilieze Nwodo kwuru na ọtụtụ otu na-anọchite anya ndị agbụụ na mpaghara dị iche iche na Naijirịa na-ekwusi maka 'restructuring' ike. O kwuru na atụmatụ nghazịharị Naijirịa na mpaghara na mpaghara nke Bekee na-akpọ 'restructuring' dị oke mkpa maka akụnaụba, ndọrọndọrọ ọchịchi ma ọ ga-eme ka udo dị na Naijirịa. Nwodo kwuru na gọọmentị a nwere ike iji afọ abụọ mee ya bụ nhazigharị. O kwuru sị ""nke a ga-eme ka ntụlịaka ọzọ a ga-eme hapu ị bụ tigbuo zọgbuo"". Gee ihe Okwesilieze Nwodo kwuru n'uju ebe a: Ọ kọwara na nke a ga-eme ka mpaghara ọbụla were ihe ha nwere leta onwe ha anya, ma sịkwa na ọ dị mkpa ka eme ya tupu ebido election. 3. Kedu Igbo nke ị na-ekwu ga-achị, ọ bụ Igbo nọ Benue, Edo,Rivers dgz? O kwuru sị "" onye igbo ọbụla banye n'ọchịchị, ya bụ na Igbo achịwago"". Nwodo kwuru na ndị Igbo agaghị ekewa onwe ha n'ihi na onye ọbụla bụ onye igbo na-asụ igbo ebe ọbụla o si , ga-anọchite anya ndị Igbo nke ọma. O kwusiri ike sị ""anyị agaghị ekewa onwe anyị ma ọrụọ oge ntụlịaka, ihe anyi chọrọ bụ ka nwaafọ Igbo chịa"". 4. Kedu ihe ndi Igbo na-eme iji chịkọlata onwe ha? Nwodo zara sị ""Naijirịa ebuka, anyi agaghi enweta ya naani anyị"" kama agbụrụ ndị ọzọ nọ na Naijirịa ga-esonye kwado Igbo inweta ihe ha na-achọ. O kwuru si ""anyị nweta ọchịchị, anyị ga-ahụ na onye ọbụla nwetara ihe ruru ha"". 5. Kedu maka ndị sị an ha achọghị Naijirịa na ha chọro Biafra? Okwesilieze Nwodo zara sị "" echeghị m na Biafra ga-enye anyị ihe niile anyị chọrọ kita"". O kwuru na nke abụọ bụ na gọọmentị Naijirịa achọghị ka Igbo naba, kama ha na-achọ ụzọ ga-adịrị ha mfe. O kwuru sị "" ọ bụghị ihe anyị ga-eji ọgụ nweta n'ihi na anyị adịghị njikere ọgụ, anyị ga-eji akọnụcha nweta ya, anyị ga-akpa ya akpa"". 6.Ụfọdụ na-ekwu na o bụruna PDP rụrụ ọru nke ọma na APC agaghị imeri O kwuru na PDP mere nke ọma n'ime afọ iri na ise ha chịrị. Nwodo jụrụ sị, ""Lee ebe anyi debere ọchịchi onye kwuo uche ya mana kịta ndịa batara kedu ebe ọ nọ?"". 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife 7. Kedụ nke ka mma; inwe pati abụọ ka ọ bụ inwe ọtụtụ? Ọ sị, ""Ọ ka mma inwe pati abụọ"" n'ihi na ha ga-enwe nkwenye doro anya nke Bekee kpọrọ 'ideology'."" Nwodo ji mba ndịọcha wetara ọchịchị onyekwuouche ya dịka Amerịka, Briten, Fransi, Jamanị ama atụ mba ndị nwere pati abụọ, abụọ. O kwuru na inwe pati karịrị abụọ bụ ""imebisi ego "" dịka o kwuru n'ụfọdụ na-eme ya iji nweta ego Inec na-eke pati. Ọ kọwara na ọ bụrụ na ị na-azọ ọkwa mana inwetaghị ohere inweta ikike na pati abụọ, ịzọ dịka 'independent'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56838470,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56838470,New Artisan Market: Ọgbaghara ọhụrụ amalitela n'ogige ndị na-ere anụmamụ n'Enugwu,"Dịka onye ntaakụko BBC nọ agba ndị na-ere anụmanụ n'Enugwu ajụju ọnụ maka ihe mere na New Artisan ụnyaahụ, ọgbaghara dakwara ebe ahụ ọzọ.","Amabeghị ndị kpatar okwu a mana ọ bu n'ogige ndị Hausa na-ere anụmamụ ka onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ tupu ọ hụ ka ndị mmadụ na-agba ọsọ. Ka ọ jụrụ ajụjụ, otu onyeisi ndị ugwu ahụ na-ere anụmanụ gwara ya na o nwere ndị na-awakpo ndị otu ha. Nwoke ahu kwuru na ndị a na-eme mwakpo ahụ ji mma ma nọdụ n'okporo ụzọ. Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ka ọ hụta ihe na-eme mana ndị ahụ wara ọgụ abịa bịasiwere ike nke mere o jiri si ebe ahu pụọ. Lee ihe onyonyo ya nwetere tupu ọ kwụsị igosi ihe na-eme n'ogige ahụ: Content is not available End of Facebook post, 1 Ebe niila adaala juu n'ogige ahịa New Artisan di n'Enugwu dịka ndị na-ere anụmanụ na ndị bịara ikutu ahịa ahụ nwechara esemokwu butere ọgbaghara. Dịka ndị hụru oge o mere gwara BBC Igbo na ọ bu oge ndị amabeghi ndi ha bụ bịara imalite ịkụrịsị ụlọ ahịa n'ahịa ahụ ka ndị na-azụ ahụ ka ndị na-azụ ahịa ebe ahụ - nke ọkankụ ha bu ndi ugwu - malitere nyenwe nsogbu. Ndị agha Naịjirịa mechara soro ndị uweojii bata n'ahịa Artisan dị n'Enugwu ma na-agbali egbe elu ịchụsasị ndị na-eme ọgbaghara ebe ahụ. Cheta na BBC Igbo nụrụ na ndị na-azụ ahịa ehi achụọla ndị gọọmentị Enugwu ọsọ n'ahịa Artisan. Ndị ahụ nọchikwara okporoụzọ e si abanye ahịa ahụ ugbua ma gbaa ọtụtụ ihe ọkụ ebe ahụ. BBC Igbo nọ ebe ihe ahụ na-eme, kirie ya ebe a n'uju Ihe Gọọmentị Enugwu na ndi uwojii kwuru mala ọgbaghara a N'akwụkwọ ozi Onye ndụmọdụ maka Mgbasaozi nke gọvanọ Enugwui steeti bụ Steve Oruruo binyere aka, gọọmentị steetị ahụ kwuru n'aka ha adịghị n'ọgbaghara a dara n'ahịa Artisan. Gọọmentị Enugwu sị na nke bụ eziokwu bụ na ha gwara ndị isi ahị a New Artisan maka njem ndị bịara mezu ikpe ulọikpe nyere banyere ala ahụ ha sị bụ nke Igwe Gabriel Nnaji - nke e ji Nwajanja mara. Ha si na ha gbara mbọ site n'ịchọrọ ndị ahịa New Artisan ebe ọzọ ha ga-anọ were zụwa ahịa mana ụfọdụ n'ime ha ekweghị ịpụ. Akwụkwọ ozi ahụ mechara kwuo na obi adịghị gọọmentị mma maka mmebi ihe ndi mmadụ ọgbaghara ahu dara na New Artisan butere ma kwuo na ha ga-aga n'ihu n'ịgba mbọ hụ na ndị niile bi Enugwu bi n'udo n'agbanyeghị ebe ha si. Daniel Ndukwe bu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu kwukwara na ha nwụchịrị mmadụ ise aka ha dị ọgbaghara a. Ọ sịkwa na ha na-aga n'ihu ime nnyocha mata ndi ọzọ aka ha dị na ya bu mkpa mkpa butere imeru ndị mmadụ ahụ nakwa imebi akụnaụba, nke gunyere ụgbọla n'ụzọ si Enugwu gawa Pọt Hakọt. Maazị Ndukwe kwenyere n'ihe gọọmentị kwuru, na ọ bụ ndị bịara imezu mkpebi ụlọikpe na ọ bụ ezinaụlọ Nwajanja nke Akpugo dị n'okpuru ọchịchi Nkanu East ka ndi nọ n'ahịa bara ọgụ malitere ọgbaghara a. Lee foto ndị si n'ogige ahụ pụta: Ụgbọala a gbara ọkụ n'ọgbahara a dara n'ahịa Artisan Ụgbọala e mebiri n'ime ọgbaghara New Artisan Ọgbọala ọzọ e mbiri n'ahịa New Artisan Ụgbọala e ji bịa ịkụrị ụlọ n'ahịa New Artisan Ebe a kụrịri na New Artisan Ebe ọzọ a kụrịrị na New Artisan Ndi si New Artisan akwapụ ụnyaahụ Ụzọ gara ahịa New Artisan n'oge ọgbaghara ahụ na-ada N'oge ọgbaghara ahụ na-ada" afirika-56987520,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56987520,Etu ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị si fanye ego na Budget 2021,Ụfọdụ ndị ọkachamara n'okwu gbasara akụnụba akatọọla etu ngalaba gọọmentị dị icheiche si afanye ego na bọjeetị n'ụzọ ezighi ezi.,"Onyeisiala Buhari ka ọ na-eche akwụkwọ mkpata na mmefu afọ 2021 n'ihu ndị omeiwu Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ BudgIT, ụlọọrọ kwụụrụ onwe ya na-ahụ maka ikwụba aka ọtọ akụnaụba na Naịjirịa, wepụtara nnyocha ha mere n'ime bọjeetị Naịjirịa nke afọ 2021. Uchenna Uwaleke, onye bụ ọkammụta n'okwu gbasara Akụnụba, gwara BBC Igbo na ụdị ihe a bụcha ụzọ gọọmentị si emefu ego n'ụzọ enweghị isi, n'agbanyeghị na ha na-ebe akwa na ego adịghị iji rụọ ọrụ. Uwaleke kwuru sị: ""Enweghị ezi nchekwa, oke ọnụahịa ọtụtụ ihe, na enweghị ọrụ, bụcha ụdị ihe ndị a na-akpata ha."" ""Ọrụ kwesịrị ịbụ nde naịra iri, ha etinye ya ụzọ abụọ maọbụ atọ, ọ bụrụzie nde naịra iri ise."" ""Ego a ga-eji rụọrọ ụmụ mmadụ ọrụ, gọọmentị a na-awufu ya. Nke a jọgburu onwe ya"" Gịnị ka a ga-eme ka ụdị ihe a kwụsị? Ọkammụta Uwaleke kwuru na otu ụzọ iji kwụsị ihe dị otu a bụ ka gọọmentị mee ka usoro bọjeetị doo onye ọbụ anya, ka ndị ọkachamara soro tinye ya anya. ""N'ụzọ dị otu a ka a ga-esi chọpụta ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị na bọjeetị ma wepu ha."" ""Tupu bọjeeti eruo n'aka ndị omeiwu, e kwesịrị ka ndị ọkachamara tinye ya anya."" ""E kwesịrị ime ka ụlọọrụ 'Auditor General' sie ike ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ ya nke ọma."" Gịnị ka BudgIT kwuru gbasara bọjeetị 2021? Ụlọọrụ BudgIT sị na nnyocha ha mere gosiri na ụfọdụ ọrụ gọọmentị sị na ha ga-arụ n'afọ 2021 pụtara ugboro abụọ n'ime ya bụ bọjeeti. Ha kwuru na ọrụ dị otu a gbara mkpị n'ime bọjeeti 2021 ruru 316 n'ọnụọgụgụ, nke ga-eri ego dị ijeri naịra iri atọ na itoolu na ụma N39( N39.5bn). Ọrụ 115 n'ime ọrụ ndị a ndị ahụ e biri ụzọ abụọ si n'aka ministrị na-ahụ maka ahụike. Nnyocha a gara n'ihu gosi na ego e tinyere na ngalaba nchekwa n'afọ 2021 dị otu tarị naịra na ụma itoolu N1.97tn nke ji pasentị iri na anọ karịa nke afọ 2020 dị N1.78tn. Akwụkwọ a sị na ngalaba ndị ọzọ na-abụghị maka nchekwa na-asị ka e nye ha ego nchekwa a kpọrọ 'security vote'. N'afọ 2021 a ọtụtụ ngalaba gọọmentị dị 117 natara ego nchekwa 'security vote' dị N24.3bn na-agbanyeghi na ọtụtụ n'ime ha dị mbụ nwe ego amawapụtara maka nchekwa. Ụlọọrụ a chọpụtara na mkpata na mmefe ngalaba gọọmentị ndị ọzọ nyere nwechachara ohere ebe a ga-esi zupu ego. N'ihi nke a, onyeisi ụlọọrụ a bụ Gabriel Okeowo gwara gọọmentị etiti ka ha gbaa mbọ mechisie ohere ndị a dị na mkpata na mmefu afọ 2021. Ọ sị na ọ bụrụ na a hapụ ohere ndị a, na mpụ na nrụrụaka ga-ejupụta na mkpata na mmefu nke afọ 2021. Lee ụfọdụ ngalaba afanyere ego na bọjeetị afọ 2021 I ji ministri na-ahụ maka ahụike maa atụ;" afirika-57028377,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57028377,Father Ejike Mbaka: Ihe ndị ị maghị maka ndụ ụkọchukwu a na-ewu ewu,Otu aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Fada Ejike Mbaka.,"Father Ejike Mbaka na ihe ndị ị maghị maka ya Fada Mbaka bụ onye ụkọchukwu n'ụka Katọlik n'Enugwu, ma bụrụkwa onye ndu ụlọekpere a kpọrọ 'Adoration Ministry'. Fada Mbaka bụ nnukwu mmadụ a na-anụ aha ya n'ụka Katọlik nakwa na Naịjirịa niile, mana akụkọ a bụ iji kọọrọ gị etu o si malite nakwa ihe mere aha ya ji ewu ewu. Ejike Mbaka(Rev Father) adọọla ndị ọchichị Naịjirịa aka na nti Onye bụ Fada Mbaka? Fada Mbaka bụ ụkọchukwu a ma ama na Naịjirịa niile n'ihi ụlọekpere ọ bụ onyeisi ya bụ 'Adoration Ministry Enugu Nigeria Ezigbo aha ya bụ Ejikemuwa Camillus Mbaka. Nna ya bụ onye obodo Ituku nke dị n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu Steeti. Dịka ndị ma Mbaka si kwuo, nna ya bụ onye dibịa na-enye ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ. Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ St Vincent dị n'Agbaogugu, Enugwu steeti. Mbaka chiri ụkọchukwu n'ọnwa Julaị afọ 1995 O mechara banye ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu a kpọrọ St Joseph Seminary Ikot-Ekpene. E chiri Fada Mbaka ụkọchukwu n'ọnwa July afọ 1995, nke a pụtara na o meela afọ iri abụọ na isii o ji bụrụ ụkọchukwu. Ọ bụ onye mgbasa oziọma e ji ikwu okwuchukwu na-akpọlite mụọ ndị mmadụ mara, ebe ekpere Wenezde nke ọ kpọrọ 'Adoration' nke ọ na-eme na-adọta nari kwuru narị mmadụ. Mbaka bụkwa otiegwu ụka a ma ama nke tipụtarala ọtụtụ egwu gụnyere: ""Miracle Worker""; ""Jesus mụ na gị ga-ebi""; Ebube Muonso""; ""Aka Ndi Muo Ozi"": ""Ike M Kwo Aba; ""Jesus Obu Ngwongwo""; ""Chideraa"" wdg. Ụkọchukwu Mbaka bụkwa onye nwe ụlọọrụ Aqua Rapha nke na-arụpụta mmiri ọṅụṅụ nakwa ụdị ihe ọṅụṅụ Bekee kpọrọ 'Yoghurt'. Ọ bụkwa onye na-ede akwụkwọ ụka na akwụkwọ ekpere dị icheiche nke o si na ya enweta ego. Dịka Mbaka ji ọnụ ya kwuo, ndị ọ na-akwụ ụgwọ ọnwa karịrị mmadụ puku iri abụọ na atọ (23,000) kwa ọnwa. Ndụ Fada Mbaka oge ọ na-eto eto Ndị ma Fada Ejike Mbaka oge ọ na-aga akwụkwọ Sekọndịrị na St Vincent Agbogugu kọwara ya dịka nwata na-ama akwụkwọ, onye ejighị ihe gbasara ụka egwu egwu. Iji maa atụ: Ọkammụta Martin Anikwe, onye ya na Mbaka gụkọrọ sekọndịrị, kọwara Mbaka dịka onye na-anọrọ onwe ya, onye ukwe na amasị nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anụ ọkụ n'obi. Ọkammụta Anikwe kwuru sị, ""Oge Mbaka ruru klassị 5, e nyere ya ọkwa 'Catholic sacristan', nke bụ onye isi ụmụakwụkwọ ndị Katọlik,"" . ""Mụ na ya nọkwa n'otu ndị ukwe oge anyị nọ n'ụlọakwụkwọ."" ""Ọ gbaghị m gharịị na Mbaka chiri ụkọchukwu ma bụrụkwa onye a ma aha ya ama taa."" 'O nweghị onye m na-asọ anya makana chukwu na-eche m'- Fada Mbaka N'aka nke ya, Ọkaiwu Damian Ajah gakwara otu ụlọakwụkwọ ahụ kọwara na ""Ihe ọzọ na-amasị Mbaka oge ahụ bụ ịgba egwu ọdịnala n'ụlọakwụkwọ."" Ihe Fada Obiekezie kwuru maka Mbaka Damian Ajah kwukwara na Mbaka bụkwa onye ihe gbasara Chineke na-amasị nke ukwuu. O kwukwara na e nwere ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ha na Mbaka na-eso ndị mechakwara chie ụkọchukwu. Damian Ajah kwuru sị: ""Ihe gbasara ụka na Charistmatic, Mbaka bu ya n'isi oge ahụ."" ""O nwekwara onye nke ọzọ n'ime ha mechakwara chie fada aha ya bụ Jacob Okoye."" ""Ha ruru mmadụ anọ maọbụ ise ndị nọbụ na Charismatic n'ụlọ akwụkwọ mechara chie fada."" Ugboro ugboro Mbaka mere ka a kpụrụ ụka Katọlik n'ọnụ 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere' 1. Amụma Mbaka maka Buhari: Oge a na-achụ nta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2015 nakwa nke afọ 2019, Mbaka buru amụma na ọ bụ Buhari ga-emeri. O kwuru na Buhari bụ onye ga-edozi obodo Naịjirịa ma bulie ya elu ọzọ. Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa Nke a butere ọtụtụ okwu ọjọọ megide Buhari nakwa ụka Katọlik, n'ihi na ndị kwuru na ọ dịghị mma ka onye ndu ụka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ. Mana Buhari merichara ntuliaka abụọ ahụ dịka Mbaka si kwuo. 2. Fada Mbaka na Peter Obi: N'afọ 2018, Mbaka katọrọ Peter Obi n'ihi na Obi ekweghị akpọ aha ego oge ọ gara emume owuwe ihe ubi n'ụlọekpere ya. Oge ahụ bụ oge nkwado maka ntuliaka e mere n'afọ 2019, nke Abubakar Atiku na Peter Obi soro zọọ ọkwa onyeieiala na osote onyeisiala. Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka N'onyonyo ya bụ ihe, Mbaka kpọrọ Peter Obi eri eri ma kwuo na ya na Atiku agaghị achịta aja. Mana Mbaka mechara rịọ Peter Obi mgbaghara maka ihe o kwuru. 3. Buhari na Hope Uzodịmma: Fada Mbaka buru amụma na Hope Uzodinma ga-abụ Gọvanọ Imo Steeti Na mbido afọ 2020, Buhari buru amụma na Hope Uzodinma ga-eweghara ọchịchị Imo steeti. Oge Mbaka buru amụma a, Emeka Ihedioha bụ gọvanọ Imo steeti, mana okwu mmeri ya ka dị n'ụlọikpe kachasị bụ 'Supreme Court'. Amụma a Mbaka buru tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na Uzodinma gbara onye nke anọ na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n'Imo steeti. 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ' Mana amụma a mechara mezuo oge ụlọikpe kachasị kpebiri ikpe ha wee chụtuo Ihediọha n'oche Gọvanọ, tinye Hope Uzodinma. Mana n'ọdị nso a, Mbaka kwara arịrị ma kwuo na Uzodinma anaghị azazi ekwentị ya kamgbe ọ rigooro n'oche Gọvanọ Imo steeti. Nke na-eme ugbua Ka ọ dị ugbua, Fada Mbaka abanyela ime ọpịpịa abalị iri atọ, nke onyeisi ụka Katọlic n'Enugwu bụ Bishọp Callistus Onaga nyere ya. O dobeghị anya ihe kpatara Bishọp Onaga ji nye Mbaka ọpịpịa a, mana ọtụtụ na-eche na o nwere ike ịbụ ihe gbasara okwu ndọrọndọrọ ọchịchị o tinyere ọnụ ya n'ọdịnso a. Cheta na Buhari katọrọ ọchịchị Buhari ma gwa Buhari ka o rituo n'ọchịchị maọbụ ka ndị omeiwu chutuo ya n'ọkwa n'ihi ndakpọ ọnọdụ nchekwa obodo. Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na Mbaka na-akatọ ọchịchị Buhari n'ihi na Buhari ekweghị enye ya ọrụ ngo ọ chọrọ n'aka ya." afirika-43446711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43446711,'Ndị ọchị ehi egbuola nwata akwụkwọ na mmadụ 4 ọzọ' na Edo,"Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi egbuola mmadụ ise na ọchịchị ime obodo Ojierakhi nke dị na Ugboha, n'ọchịchị ime obodo ndịda ọwụwa anyanwụ Esan n'Edo Steeti.","Ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị a na-ekwu na-akpa ike dị icheiche Mkpam kpa a metụtakwara ndị obodo Odiguetue nke dị na ọchịchị ime obodo ọwụwa anyanwụ ugwu Ovia na steeti ahụ. Mmadụ 12 merụrụ ahụ na mwakpọ a, nọ n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ ugbua. Ihe a mere na Ugboha n'abalị Fraịdee dịka ojiri 'ọkara gafe elekere asaa. Mmachị ọchị ehi Ụlọ ntaakụkọ Sun News nke Naịjirịa dere na otu onye e gbụrụ bụ Collins Ojierakhi bụ nwataakụkọ na mahadum Ambrose Alli di n'obodo Ekpoma nke steeti ahụ. Ndị ma maka ihe a mere kwuru na Collins na ndị enyi ya na-ala obodo ha mgbe ha jekwuru ndị ọchị ehi jiri ehi gbachie ụzọ. Nna Collins bụ Maazi Festus Ojierakhi, siri na ihe a mere gbagwojuru ya anya, ""A nọ m na-eri nri ka ọ na-ewete aka n'elekere asatọ, mgbe m jụru ese ọkpara m e wee gwam na ya na ndị enyi ya ji ogbatụmtụm ga ozi. Ka okụrụ elekere itoolu, nne enyi Collins tịwawara mkpu na ndị ọchị ehi egbuola nwa ya. dịka m gbapụrụ ezi, e wee gwam na nwam soo n'ime ndị nwụrụ. ""Anyị gbagara ebe ihe a mere wee hụ na ndị uweojii buru ozu ha gawa ụlọọgwụ."" BBC Igbo gara mbo iwete onye na ekwuchịtere ndị uweojii na Edo Steeti bụ Emeka Iheanacho mana ekwenti ya agaghị. A na-ebo ndi ọchị ehi ebubo maka ogbugbu mmadụ n'ebe dị icheiche na Naịjirịa. Gọọmenti Muhammadu Buhari, bụkwa onye Fulani, sị na ha na-agba mbọ ịhụ na ogbugbu mmadụ a kwusiri kpam kpam." 47375779,https://www.bbc.com/igbo/47375779,Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ,Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala afọ 2019.,"Buhari nke APC nwere vootu kachasị dịka o ji vootu dị 15,191,847 tipụ Atiku nke PDP onye nwetara vootu dị 11,262,978 anyammiri n'anya. N'ịkpọpụta onye meriri, onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na n'ebe vootu karirị ndị a nabatara ịtụ vootu, na ndịiche dị na ndị a nabatara ịtụ vootu na vootu a tụrụ adịghị nnukwu. N'okwu ya, Yakubu kwuru na o rughị pasent abụọ. Onye nnochite PDP bụ Osita Chidoka kwuburu na e nweghị nkọwa ọbụla maka vootu dị nde 1.669. Ọ kpọrọ oku ka Inec hapụ ịkpọpụta onye mmeri ganye mgbe e nyochara ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ. Mana PDP ajụla mpụtara ntuliaka ahụ. PDP rịọrọ ndị Naijiria ka ha jụ mpụtara Inec wepụtara ma ọ bụrụ na Inec jụ iwepụta ngụkọ nke igwe 'cardi reader.' Ka ọ dị ugbua, Inec ga-enye ya Buhari na Osote ya bụ Yemi Osibanjo asambodo mmeri n'Elekere Abụọ nke ehihie taa bụ Wenezde. Akụkọ ga-amasị gị:" media-46452915,https://www.bbc.com/igbo/media-46452915,Lagos: Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na 3rd Mainland Bridge,Akụkọ dị mkpa Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ,"E meriri onye osote Gọvanọ Fayose bụ Kolapo Olusola-Eleka na ntuliaka gọvanọ e mere n'Ekiti na nso nso a. Akụkọ na-eru Igbo ntị ugbua na-ekwu na Gọvanọ ochie ndị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na akwammiri nke atọ dị na Legos n'ihihie Wenezde. Odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Lere Olayinka depere nke a n'akara Twitter ya. Gabriel Onyewife na-anọchite anya Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nke nta Onye na-anọchite mpaghara Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nta bụ Gabriel Onyewinfe agbarala APGA ụgbọ nwamkpi, ma banye PDP. Onyeisi ụlọomeiwu bụ Yakubu Dogara gbara ama nke a oge ọ gụpụtara akwụkwọ ozi nke Onyewinfe detara n' ụbọchị Wenezde. Nwaanyị nwụrụ n'aka di ya Jessica Patel bụ onye na-akụ ọkwụ bekee N'ofesi, otu nwoke ahịgbuola nwunye ya maka na ọ chọrọ ka ya na nwoke ibe ya biriwazịa ka di na nwunye. Mitesh Patel gbara afọ iri atọ n'asaa (37) ga-aga nga afọ iri atọ maka igbu nwunye ya bụ Jessica dịka ọkaikpe Justice Goss si kpebie. N'egwuruegwu, James Tarkowski gbara bọọlụ ikpeazụ ya na ụbọchị atọ nke Nọvemba 2018 N'egwuruegwu, Burnley na Liverpool ga-ezute n'Elekere asaa an mmede a ebe Everton na Newcastle ga-akwatakwa otu mgbe ahụ na Goodison Park. N'aka ọzọ, Man. U na Arsenal ga-akwakọrịta mpi n'Elekere asatọ an Old Trafford. Gee nkeji mmgbede ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Buhari na ụmụaka Chibok Buhari kwuru na ọ bụrụ na ụmụaka Chibok alọtaghị, na ya aghaghị ezuike Onyeisiala Muhammadu Buhari na ibe ya nke Swiss bụ Alain Berset, ezutela na Katowice dị na Poland ebe ha kpara maka ụzọ ọhụrụ ha ga-esi wee gbapụta ụmụakwụkwọ Chibok ka fọrọ n'aka ndị ntọ ha. Ha zukọrọ ka e mechara ọgbakọ UN gbasara ihu eligwe nke a kpọrọ ""COP24"". Elrufai akatọọla Atiku El-Rufai kwuru na PDP bitere ndị Niger ka ha bịa nọnyere ha n'achụmnta vootu Aka na-achị steeti Kaduna bụ Nasir el-Rufai, ekwuola na pati PDP gara bite igwe mmadụ n'obodo Niger ka ha bịara achụmnta vootu ha mere n'ụbọchị atọ nke Disemba, 2018. Mana ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan, kwuru na Elrufai ekwuputela etu pati APC si akwado ịtụbụta ndị mba ofesi na ntuliaka 2019. N'egwuregwu, ManCity ejirila poinyi ise gafee ndị nọ ha n'okpuru Onyeisi otu egwuregwu bọọlụ Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na etu otu ya si merie n'ikpeazụ dịka otu Watford nyechara otu ọkpụ goolu ebe ha agbatabeghi nke ọbụla, mgbe ha ka na-asọmpi ụnyaahụ (Disemba 4, 2018) gosiri na ị kwesighị izu ike n'asọmpi Premier League. Mmeri a buliri Mancity n'elu tebulu Premier League dịka ha chịtarala pọịntị ise . N'ofesi, N'ime mmadụ iri ndị anatara akpa nwa onye nwụrụ anwụ wee tinye n'ahụ ha, nke a bụ nke mbụ nwerela isi Otu nwaanyị amụọla akataka nwa nwaanyị ọhụrụ ka e werechara akpa nwa si n'ahụ nwaanyị ọzọ nwụgoronu tinye na nke ya. Ihe a mere na São Paolo dị na mba Brazil. Akụkọ kwuru na nwaanyị a dị afọ iri atọ na abụọ enweghị akpa nwa kamgbe amụrụ ya. Nkeji ututu Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri Burundi: Ụlọ ana-egbu mmadụ ka ọkụkọ" afirika-45800877,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45800877,2019 election: Ohaneze ekpebibeghi onye ha ga-akwado - Nnia Nwodo,"Ka ntuliaka 2019 na-abịa nso, onyeisi ngalaba na-ahụ maka ihe metụtara ndi Igbo akpọrọ Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na otu a ekwubegbị onye ha ga akwado.","Ihe Nwodo kwuru maka ntuliaka 2019 na okwu restructuring Nwodo kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọro ya n'ekwenti maka mkpebi Ohaneze banyere ntuliaka 2019. O kwuru na agbanyeghị na Ohaneze na ndị otu ọzọ dịka ha na mpaghara Naịjirịa ọzọ nwere nzukọ ebe ha kpebiri na onye ha ga-akwado na ntuliaka na-abịa bu onye kwenyere na ihe Bekee kpọrọ ""Restructuring"", o rubeghị mgbe a ga-akpo okwu ezigbo aha ya. Nwodo si na ihe mere nke a bụ na ndị na-azọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa karịrị, nke ụfọdị n'ime ha bụ ụmụafọ Igbo. ""Oge erubeghi mgbe anyị ga-ekwu onye anyị ga-akwado, mgbe oruru, anyi ga-ekwu okwu."" Okwu Nwodo a pụtara n'azụ ụfọdụ ulo ntaakụkọ dere na Ohaneze ga-akwado onye ndọrọndọrọ kwadoro ""Restructuring"". Atiku Abubakar, bụ onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anoghi n'ọchịchi bụ Peoples Democratic Party (PDP), kwuru okwu ọfụma maka ""Restructuring"" a, bu atụmatu o sị na ya kwadoro ọfụma. Onwekwara ndi na-ekweghi n'ihe Abubakar na-ekwu bụ ihe o ga emenwụ, makana mgbe ọ bụ osote onyeisiala n'ọchịchị Olusegun Obasanjo, ejiji nkwado mmegharịa obodo n'ụdị a mara ya. Gee Nwodo ntị n'elu: N'akụkọ yiri ibe ya, ndị otu IPOB kwukwara na he akwadoghi ka onye Igbo pụta ka osote onyeisiala n'okpuru PDP maka ha sị na ihe ha chọrọ bụ nkewa, maọbụ nke Bekee kpọrọ ""Referendum"", nke nkwereike ibute nkwekọrịta nkewa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42953908,https://www.bbc.com/igbo/42953908,Otu nwata akwụkwọ anwụọla na mahadum Yola,Emechiela Modibbo Adama Yụnịvasiti dị na Yola Adamawa steeti.,"Ugwu hausa enweela ọtụtụ nsogbu gbasara nsogbu uka Nke a mere ka ụmụ akwụkwọ mechara ngagharịiwe nke butere ọnwụ otu nwata akwụkwọ ebe aagbara ụlọụka ndị alakuba ọkụ na mahadum ahụ. Otu nwata akwụkwọ mahadum ahụ nke achọghị ka-akpọ aha gwara onye ntaakụkọ BBC mbọ a gbara ịzọ nwaakwụkwọ ahụ ndụ amịtaghị mkpụrụ. ""E buru ya ga ụlọọgwụ n'abalị ụnyaahụ mana ọ nwụrụ n' ụtụtụ taa."" O kwukwara na ihe butere ọgbaghara ahụ bụ obi ilu nke sotere ntụliaka otu ụmụakwụkwọ a kpọrọ 'Student Union' na bekee nke ndị nwere mmeri bụkarịrị ndị ụka Kraist. ""Ụnyaahụ otu onye ụka zipu ozi na Whatsapp nke ụmụ akwụkwọ ndị Engineering. Ozi nke a bụtere ezigbo iwe n'afọ ndị uka alakuba."" Ọ gara n'ihu kwue na ""Taa ka anyi kwesịrị i bido ile ule. Mana ihe a merenu emebiela ihe niile."" N'ime akwụkwọ ozi onye registra ụlọ akwụkwọ ahụ zipuru, o kwuru na onweghị nwa akwụkwọ ọbụla e kwesịrị ihu n'ala mahadum ahu site na elekere abụọ nke ehihe taa." afirika-44927538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44927538,Ntuliaka 2019: Bukola Saraki ekwuola na ya anataghị ngarị ọbụla,Onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki agọrọla ụkwụ na aka ya na ya anaghị ngarị ọbụla dịka otu ihe so na mkparịtaụka na-aga n'etiti onyeisiala na otu pati APC.,"Ọ kwuru na okwu ahụ bụ asị ma kọwaa na ihe a na-ekwu maka ya bụ ọdịnaihu ala Naịjirịa na ọchịchị ya nke onye ọbụla na-ekwu maka ihe e nyere na nke enyeghi na-achọghị ọganihu obodo. N'akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ya bụ Yusuph Olaniyonu dere, Saraki kwuru na ya hụrụ ụfọdụ akụkọ na-ekwu maka ego na ọmị mmanụ na akwụkwọ ikike ịzọgharị ọchịchị mana kwuo na ndị na-ahụa ihe na-eme ugbua etu ahụ na-ahụta ihe gbasara ala niile dịka ihe gbasara naanị ha. N'okwu ya; ""Ọ dị mkpa ka ụmụ Naịjirịa mata na mkparịtaụka m na ọtụtụ ndị ọzọ na-eme gụnyekwara ụlọọrụ onyeisiala na ndị otu pati APC abụghị maka onwe m na ihe m chọrọ. ""Ọ bụ maka ọdịnihu ala anyị na ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụ maka ime ka ihe dị mma nye ndị ala anyị"". ""Anyị ga na-akparị ụmụ Naịjirịa ma ọbụrụ na dịka ntuliaka 2019 nabịa, ihe ka anyị mkpa abụrụ ihe gbasara onwe anyị."" Saraki na ndị isi otu pati APC na-enwe mkparịtaụka maka kepu kepu na-ekwu na ọ chọrọ ịpụ na pati ahụ banye patị ke si na APC kewapụa nke a kpọrọ R-APC. Onwebeghi ihe Saraki kwuru kemgbe e kewapụtara pati ọhụrụ ahụ mana ọ bụ ndị obi adịghị mma nọ n'ụlọomeiwu n'APC bụ ndị kewapụtara pati nke ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48616564,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48616564,"Democracy Day: Buhari emezụghị nkwa o kwere - Ohaneze, CUPP","Dika a na eme mmeme ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya, ndị Ohaneze na CUPP ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari mezughị nkwa o kwere ndị Naijirịa ka ọ banyere n'ọchịchị n'afọ 2015..","Okwu.I.Okwu, Dubem Onyia na Chinedu Nebo Okwu a na-eso ihe Buhari kwuru na mmemme ụbọchị Ncheta ọchịchị onyekwuoucheya e mere n'Abuja ụbọchị Wenezde Juun 12, afọ a, ebe ọ sịrị na o mezuru nkwa o kwere gbasara nchekwa, akunauba obodo na nrụrụaka. Onye odeakwụkwọ Ohaneze bụ Chuks Ilegbu gwara BBC Igbo na ""Buhari nwara ike ya mana o zughị oke"". N'uche Ilegbu, Boko Haram, ndị ntọ, ndị Fulani ọchịehi na ndị ohi ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara dị icheiche na Naijiria. Ụmụ Naịjirịa na-anwụ n'ọchịchị nchịgbu Buhari Kenneth Udeze bụ ọnụ na-ekwuru otu jikọrọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị na gọọmenti a kpọrọ 'CUPP' n'aha ịchafụ mabụrụkwa onyeisioche otu 'Action Alliance' si na "" ọ bụghị eziokwu"" na Buhari mezuru nkwa o kwere ụmụ Naịjirịa. Udeze ọ sịrị ""mmadụ ruru puku nari asaa bụ ndị nwụrụ n'ọchịchị nke Buhari."" Mana Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ na mgbasaozi otu APC kwuru na Buhari mezuru ihe o kwuru. O nweghi onye megidere ndị aka azụ na Naịjirịa ka Buhari O kwuru na ""e kwube maka nchekwa, ọ bu ndị daara ntunyeaka na-eme ihe ndị a ka o were dịka onyeisiala amaghị ihe o na- eme."" Ọ gara n'ihu kwụọ na ""o nweghị onye rụrụ ọrụ megide ndị akaazu na Naịjirịa dịka onyeisiala siri rụọ."" Na otu aka ahu, onye odeakwụkwọ na Mgbasa ozi nkendi otu ndọrọndọroochịchị bu APC kwadoro Ọnyeisiala were kwuo si na 'onweghị onye ruru ọrụ megide ndị akaazu na Naịjirịa dịka ọnyeisiala siri lụọ. ọ natara ha ego, tinye ha na nga, nata ha ụlọ. N'ihe gbasaara Umunwanyi na Ndọrọndọrọ ọchịchị Ndị a niile kwadoro ụmụnwaanyi isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ekwu na ihe ga-adi mma ma ọ bụru na ụmụnwaanyị sonye n'ọchịchị Lee etu mmemme ụbọchị ọchịchị onyekwuouche ya siri were gaa:" 42900254,https://www.bbc.com/igbo/42900254,CHAN 2018: Super Eagles eruola agba nke ikpeazụ,Naịjirịa eruola agba nke ikpeazụ n'asọmpi CHAN afọ 2018 a na-agba na mba Morocco.,"Gabriel bụ onye nyere ọkpụ golu nyere Naịjirịa mmeri ha meriri Sudan Nke a na-esote mmeri ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles ndị na-agba n'ụlọ meriri mba Sundan n'abalị ụnyaahụ. Super Eagles gbara ha otu ọkpụ a na-asataghị. Ọkpụ golu Okechukwu Gabriel nyere golu na mbido ya bụ asọmpi nke nyere ndị Super Eagles ọkwa ebe ha nọ ugbua. Ha ga-agba ndị otu Atlas Lions nke mba Moroco ụbọchị ụka maka agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ. N'isi ụtụtụ asọmpi ahụ na nkeji iri na abụọ ka ndị Super Eagles nwere ihe imaakanaihu dịka otu onye otu ha bụ Ikechukwu Ezenwa meruru ahụ e wee webata Dele Ajiboye. Ka nkeji atọ gara, Sudan nwere ọmarịcha ohere ịbụ ndị ndu n'asọmpị ahụ mana Ajiboye hụrụ nke a n'oge ma jikwaa ha. Mana Naịjirịa hụrụ ohere n'otu nkeji na-eso dịka Gabriel kpara Elhadi Akram wee gbanye bọọlụ ahụ n'ihu golu. Agbanyeghi mbọ niile ndị otu Falcon nke Jediane gbara, Super Eagles nọ na-edu oge ha gara ezumike ọkara oge. N'ọkara nke abụọ, Super Eagles nọ na-eyi ha egwu mana adọghachiri ha azụ na nkeji iri ise na asatọ oge a chụpụrụ Ifeanyi Ifeanyi maka ajọ ọkpụkpa. Ndị Sudan chọrọ iji ohere ahụ gbaa mbọ mana Ajiboye enyeghị ha ohere ọbụla. Oge ọ fọrọ nkeji atọ ka ha gbasịa, ewebilatakwara ndị Sudan rue mmadụ iri oge e nyere Bakri Bachir kaadị mmemme maka igbatu Solomon Ojo. Ajiboye dosekwara Naịjirịa n'ihu dịka ọ sọchara Super Easgles ugbo abụọ na nkeji iri itoolu. Mmeri a Super Eagles meriri Sudan pụtara na ndị Sudan ga-agba ndị otu Mediterranean Knights na Libya ịzọ ọkwa nke atọ ụbọchị Satodee." egwuregwu-44507971,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44507971,World Cup 2018: Aịsịland na Ajentina agbaala onye laba onye laba,"Ka Ajentina zutere ndị Iceland na asọmpị nke abụọ nke ""Group C"" ndị mmadụ nwere olileanya na ha ga-akwọrị ha.","Argentina nwere Messi na ọtụtụ ndi ọzọ nwere aha na egwuregwu bọolụ na mbaụwa. Mana Iceland abughị ndị a na-akwa aka ka onye ṅụrụ mmanaya. Na afọ 2016 ha gbara mbọ ruo ọgba nke anọ na asọmpị mba Yurop akpọrọ Euro 2016. Ihe tụru ndị mmadu n'anya bu na ọ bu mbụ ha na-aga asọmpị Euro. Argentina na ọnwe ha eritebeghị iko mbaụwa ọbụla kemgbe ha nwere mmeri na Copa Amerịka nke 1993. Ndị na-akwadọ mba Ajentina n'ọgbọ egwuregwu kunyiri na nkeji 19 n'ime asọmpị ahụ ka Sergio Aguero jiri otu ọkpụ dọkaa neeti ndị Iceland Mana, ọchị di ha n'ọnụ gbachapụrụ n'elekere 22 mgbe Aisland, site na ọkpụ Finbogasson saghachịrị goolu ahụ we mezuo ya otu otu na mmechi agba nke mbụ. Na nkeji 51 na agba nke abụọ, Aisland ritere corner kick nke Sigurdsson gbara ha mana ọ pụtaghị ihe. Eji Bigblia gbanwe Banega nke Ajentina kwa na nkeji 54. Messi a na-atụ anya na ọ ga-edu ndị Ajentina nke ọma gbahie lu ọkpụ penariti na nkeji 64. Messi gbahielu ọkpụ nke abụọ ya na nkeji 81. Ka o ruru nkeji 84, Ajentina mere mgbanwe nke atọ na nke ikpeazu ha n'iwepu Meza tinye Higuain. Ka agba nke abụọ na-abịa n'isi njedebe Haldorsson bụ onye nche goolu aisland e chetala ihe rurugoolu ato n'aka ndị Ajentina. Na ọma oge e nyere, Leonardo Messi gbara penariti mana ọ banyeghị n'ime neeeti dịka ogbu opi si gbuo ị ji gosi n'oge ezuwo. Ya mere na ọ pụtara sọsọ otu goolu ka Ajentina na Aisland jiri laa taa." afirika-53928750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53928750,"Ite paụda, ili eriri otubo na omenala ndị ọzọ Ndigbo na-eme n'oge ọmụgwọ",Ọtụtụ omenala Igbo nwere bụ ihe ndị mmadụ ka na-akwadosi ike n'agbanyeghị na ọtụtụ amaghị ihe ha pụtara.,"Ịma atụ bụ etu mmadụ na-esi ete nzu Bekee a na-akpọ ""powder"" n'ihu maọbụ n'aka ma ọ garuo ebe a mụrụ nwa ọhụrụ, mana ọtụtụ amaghị ihe ya na ya so. Akụkọ a ga-etinye anya n'ụfọdụ omenala ndị a na mpụtara ha. 1: Ite nzu maọbụ 'paụda' Maazị Ozioma Odinani bụ onye ihe omenala Igbo na-adị mma, kọwara na ""powder"" bụ ihe ndị agba ọhụrụ ji mere nzu. N'Igbo gboo, nzu bụ amụma ọcha. Talcum Powder: Kwụsilata ka isi ete nzu bekee maka ọrịa Kansa- Ọkammụta akpụkpọahụ Ozioma sị: ""a mụọ nwa ọhụrụ, a na-ahụ ya dịka onwe enweghị njọ, nke mere ndị mmadụ ji ete nzu iji mee ọṅụ nwa. Ihe aka e tere nzu pụtara: Ebe e tere nzu nwekwara ihe ọ pụtara. Ị hụ onye si ebe a na-eme ọṅụ tere nzu n'aka nri ya, o gosiri na ọ bụ nwa nwoke ka o si ọṅụ ya. Ọ bụrụ n'aka ekpe, ị mara na ọ bụ nke nwa nwaanyị. 2: Ili eriri otubo Eriri otubo nwa so n'ihe a na-akwanyere ezigbote ugwu n'ala Igbo. Dịka omenala siri dewe, a na-eli eriri otubo ebe a mụrụ nwa ahụ. Ya bụ, ugbua a na-aga ije, n'usoro omenala, e kwesịrị iwere eriri otubo nwa laa obodo nna ya gaa lie ya. Omenala a abụghị ihe a ka na-emesi ike ugbua, mana ụfọdụ ka na-eme ya. 3: Ili alọ (placenta) Dịka eriri otubo, alọ bụkwa ihe a na-asọpụrụ nke ukwuu n'ala Igbo. Dịka eriri otubo, a na-eli uwo n'ebe nwa a mụrụ ọhụrụ si. Etu o si kwụrụ bụ na a ga-ahọta otu ukwu osisi n'ezinaụlọ nwa ọhụrụ ahụ, ma lie uwo ya n'ukwu osisi ahụ. Mana, ugbua, anaghịzị emekarị ya. 4: Ime ọmụgwọ Mmadụ niile ma ihe bụ ọmụgwọ, nke bụ mgbe nne nwaanyị maọbụ nne di ya nọnyetụrụ ha iji nyere ha aka. Ọtụtụ mmadụ na-ahụ uru ọmụgwọ bara na etu nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ga-esi nwete enyemaka nakwa nkwado. Ọmụmụ na-esokwa ya, ọkachasị ebe nwaanyị amụbeghị nwa mbụ. 5: Ịgụ nwa aha Ndị Igbo na-eme emume ịgụ aha site n'ụbọchị asaa ruo ụbọchị 12 a mụchara nwa. Ihe a bụ oge a na-egosi obodo nwa ahụ. N'emume a, ezinaụlọ nakwa ndị obodo na ndị enyi ga-ezukọ kpeere nwa ahụ ekpere. Ugbua, ọtụtụ mmadu na-agazị ụka ime emume a ebe ọtụtụ anaghị eche ka oge a ruo tupu ha a gụọ nwa aha. 6: Ibi ugwu Ibi ugwu bụbu ihe a na-eme nwa nwoke nakwa nwa nwaanyị, mana ugbua, ọ bụzị sọsọ nwa nwoke ka a na-ebi ugwu. A na-ebikarị nwa nwoke ugwu ma ọ gafechaa abalị atọ maọbụ karịa, a mụrụ ha. A na-asị na ọ dị mma ibi ugwu ahụ tupu nwata amata na ihe na-afụ ụfụ, dịka a na-eche na ihe anaghị afụ nwa ọhụru ụfụ etu ọ sị afụ nke katarala ahụ. Amachaghị uru ibi ugwu baara ndị Igbo mana a na-ekwu na ọ bụ ihe si n'oge gboo." afirika-43276116,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43276116,EFCC kwuru na ha ga-amachi ike ego na ndọrọndọrọ ọchịchị,"Ka a na-ahazi ntuliaka nke aga eji họpụta ndị ga-achi obodo dị icheiche na Nigeria n'afọ 2019, otu na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC sịrị na ha ga-etinye anya ha nnukwu ego ndị otu ndọrọndọrọ na-ekegharị iji zụta mbinyeaka .","EFCC si na ha ga-agbachi ebe obụla na-ehi ehi. Onye kwuru nke a bụ onyeisi ndị EFCC bụ Maazi Ibrahim Magu. Magu gbara ama a mgbe ọ nọ n'emume a na-akpọ ""Question Time"" na Channels Televion ụnyaahụ. Magụ sịrị, ""Anyị na INEC na-arụkọ ọrụ ịhụ na anyị gbachiri mpio niile n'ebe niile ihe si ehi tupu eme ntuliaka nke 2019. Anyị ga-agbachi ebe ọ bụla ndị mmadụ si ebugharị ego, ma ọ bụ n'ọbaego, ma ọ bụ n'ihie."" ""Anyị ga-egbochi ndị mmadụ iji ego zụọ mbinyeaka, ma ọ bụ iji ego zụta ndị a na-akpọ 'delegates' n'asụsụ bekee ma a na-eme mbinye aka eji ahọpụta ndi ga-anọchite anya ndị pati na ndọrọndọrọ ọchịchị. Anyị ahazịela ihe anyi ga eji me ihe a,"" Magu kwuru. Ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na onye ode akwụkwọ n'otu pati PDP bụ Kola Ologbondiyan gwara ha na EFCC enweghi ikike itinye anya n'ihe gbasara ego ndọrọndọrọ. O kwuru na ọ bụ INEC nwere ụdị ikike a. Mana, Punch dekwara na onye ode akwụkwọ mgbasa ozi nke APC bụ Mallam Bolaji Abdullahi gwara ha na pati ya na-abatara ihe EFCC kwuru na ha ga-eme. Naịjirịa ga-eme ntuliaka a ga-eji họpụta onye ga-abụ onyeisiala, ndị gọvanọ na ndị ọchịchị ndị ọzọ n'afọ 2019. Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwubeghị ma ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ, mana a na-ele anya na ọ ga achọ ka ọchịa afo anọ ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48843390,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48843390,Anambra doctors strike: Ego a na-akwụ ndị dọkịta dị obere mana ha nwee ndidi,Ọ bụghị zi akụkọ na ndị dọkịta Anambra Steeti ka nọ n'abụbụọrụ nke ha malitere kamgbe izuụka asa gara aga.,"Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Ọtụtụ ihe bụ ihe ha gụpụtara bụ iwe mere ha ji na-agba abụbụọrụ. Gịnị bụ iwe ha? Onyeisi ndị Dọkita n'ụlọọgwụ OOUTH bụ Aniagbaoso gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe bụ iwe ha. Kọmishịona na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Don Adinuba tinyere ọnụ n'okwu a n'aha gọọmenti. N'okwu ya ""Gọvanọ Willie Obianọ maara na ego a na-akwụ ndị dọkịta abụghị ihe ekwesiri ịkwụ ha, ya mere o ji welikwuo ego ha mgbe ọ bara ọchịchị."" Adinuba kwuru na gọọmenti gwara ndị dọkịta ka ihe ọbụla gbasara ụgwọ ọnwa chere ka e kwuchaa okwu ụgwọ opekatamkpe tupu eleba ya anya. O kwuru na ndị dọkịta na gọọmentị enweela mkparịtaụka ọtụtụ oge na ọ bụ otu ihe ahụ ka-agwara ha, ka ha nwee ndidi. Don Adinuba maka ndị ọchịehi Fulani. O kwuru na dị ka ọ dị ugbua na gọọmetị na-eji ego ruru ijeri naịra anọ akwụ ndị ọrụ ụgwọ, tinyere ụgwọ opekatampe ọhụrụ ga-eru ijeri naịra abụọ na ọma. N'ajụjụ ego ole gọọmenti Anambra ga-akwụ ụgwọ opekatampe, O kwuru gọọmenti Anambra ga-akwụ ego ole gọọmentị etiti kwuru bụ puku naịra iri atọ. N'ikpeazụ Adinuba kwuru na ndị dọkịta ga-akwụsị ya bụ abụbụọrụ. Akụkọ ga-amadị gị:" afirika-47925002,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47925002,Ụkọ ụgbọala Keke akpọwala ndị mmadụ n'ụzọ n'Abịa steeti ka iwu ọhụru malitere ọru,Akụkọ ruru BBC Igbo nti site Abịa steetị na-akọwa na ndị njem tọọrọ n'ụzọ ụnyaahụ bu ụbọchị nke iri na ano nke ọnwa Epreelu 2019.,"Foto ezitere BBC Igbo na-egosi ndị mmadụ nọ a okporo ụzọ na-eche ụgbọala ga-eburu ha gawa ebe ha na-aga. Kọmịshọna mgbasa ozi n'Abịa steeti bụ John Okeiyi gwara BBC Igbo na ihe kpatara ojiri di etu a bụ makana ụnyaahụ bụ ụbọchị mbido atumatu ọhụrụ gọọmentị Abịa wepụtara iji belata oke mpụ ntọọrị mmadu na-eme n'Abịa. Ọ sị na: ""Ọ bụ site elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere itoolu nke abalị ka keke na-agba mbụ, mana gọọmentị Abịa welatara ya elekere asaa. Ụnyaahụ bụ mbido ya, ya mere oji gbagwojuo ndị mmadụ anya.""BBC jụrụ ma etinyekwere ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'uche mgbe a na-ehibe iwu a. Maazi Okeiyi sị na ihe a bu obele ahụhụ ndị mmadu ga-ata nwa mgbenta, makana ""na o ga dị etu a ruo mgbe ahazichara nchewa, karịa iji ya bụ usoro na-atọọrị ma na-ezu ndị mmadụ ori. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọgaghị adịghịde. ""Ahazicha usoro nchekwa, anyị ga-achọ ka ọbụrụ mgbe niile ka keke na-agba."" Lee ihe nkiri a Iwe mpụtara ntuliaka Gọvanọ jị Alex Otti Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44024242,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44024242,Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Cardiff city abaala Premier Lig,Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Egburu ọchụ na Birnin Gwari ọzọ.,"Ndị agha Naịjiria nyere ndị nche obodo aka ịchọta ozu ndị mmadụ Ndị nche obodo na ndịagha Naịjirịa ebupula ozu ruru iri anọ na ise n'obodo Gwaska ebe ndị omekome wakporo Birnin-Gwari ọzọ. Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ma na-atụ egwu na a ga-achọta ozu ndị ọzọ n'ọhịa. Ebe ọzọ na Naịjirịa. End of Twitter post, 1 Ihe iru uju emetụtala ndị uweojii ka mmadụ ise ndị uweojii nọ n'ọzụzụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ. Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha. Akụkọ kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee. Na Mba ofesi, Ide yiri nke a burukwara ụgbọala n'afọ 2017 Ide mmiri sitere n'oke mmiriozuzo emerụọla mmadụ isii ahụ na mba Turkey. Ide a burukwara ụfọdụ ụgbọala ma mebie ọdọ ahịa dị icheiche n'isi obodo Turkey bụ Ankara. Enweghị onye nwụrụ n'ime ide a. N'Egwuregwu, Otu Cardiff city na-eme emume mbugo ha na Premier Lig Ka a na-ahazi ọkwa Premier League maka imechi asọmpị ahụ, ka a na-ahụkwa ndị mmeri na ndị emeriri. Cardiff City esonyela na ndị a ga-ebuba n'ọkwa Premier League ugbua, ebe otu bọọlụ Birmingham meriri Fulham Gee nkeji anyị na mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49460158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49460158,Plane Crash: Ụgbọelu abụọ sukọrọ ọnụ egbuola ihe ruru mmadụ asaa na Spain,Ihe ruru mmadụ asaa anwụọla dịka otu helịkọpta na ụgbọelu ntakịrị ọzọ kụkọtara isi n'elu n'obodo Mallorca dị na mba Spen.,"Okpokoro si n'ụgbọelu ahụ dasara n'akụkụ ụzọ Inca dị n'obodo Mallorca Akụkọ kwuru na mmadụ abụo na-erubeghi afọ iri na asatọ so na ndị ọ tara isi ha. Mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede a, gụnyere ụmụntakịrị abụọ a, nọ n'ime helịkọpta ahụ, ebe abụọ ndị ọzọ nọ n'ime ụgbọelu fecha-fecha nke ọzọ nwere naanị oche abụọ. Maapụ ebe ihe a mere Mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu steeti Akụkọ ruru anyị ntị na-akọwa na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Ikirike dị n'Idaw-river, n'Enugwu steeti n'isi ụtụtụ a wee merụọ ụfọdụ ndị uweojii ahụ mana enweghi onye nwụrụ. Ndị omekome a bu mma na osisi, ji aghụghọ na ha bịara ime mkpesa bata n'ime ụlọorụ ndị uweojii ebe ha nọ kpaa mkpamkpa ha ma gbalaga. Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ, kwuru na ha atụọla imi n'ala iji chọpụta ndị omekome ahụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị omekome awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugu state Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya ebe a: Gọọmentị na-adọ ndị ""sabo"" aka na ntị Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-agba onye ọbụla ga-agba ngalaba ha hibere a kpọrọ Social Investment Programmes mgba okpuru, akwụkwọ. Maryam Uwais bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye onyeisiala Naịjirịa, kwuru nke a ka ọ na-akọwa na gọọmentị ga na-eme ihe niile ịhụ na ngalaba ahụ rụrụ ọrụ e ji hibe ya, n'ụzọ kwụ ọtọ. N'egwuregwu, Sergio Aguero nyere goolu abụọ n'ime atọ Manchester City nyere iji merie Bournemouth Manchester City gosiri ihe ha ji bụrụ dike dịka ha ji goolu atọ a satara naanị otu zọgbuo Bournemouth ka agbụsị. Nke mere ka ha nwee pọintị asaa ugbua ma nọrọ n'ogogo nke abụọ na tebulu Premier League. Gọọmentị kwụsịnụ iji aka ike eso ndị ngagharịiwe - Soyinka Ọkammụta n'ide akwụkwọ bụ Wole Soyinka adọọla gọọmentị aka na ntị banyere iji aka ike na-anwụchi ndị na-eme ngagharịiwe dịka ọ bụ ikike ruru ha. O kwuru nke a na-emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya na Satọde 23 Ọgọst, 2019 dịka ọ gbarala afọ 85. Soyinka sị na ihe ụtọ dị n'obibi ndụ bụ mmadụ inwe ohere ikwupụta uche ya n'oge ọbụla. N'okwu ya "" Ọ bụ ikike dịrị onye, anyị agaghị agbaha ya ma ọ dị mkpa ka e zigara gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa ozi a ka ha ghara ịkpachị ndị gbakọtara na ntụgharị uche."" O kwuru na ụlọọrụ gọọmentị kwesiri ịkwanyere ikike dịrị ndị ugwu ma ọ bụrụ na ha ekpebie iji ngagharịiwe gosi mwute banyere ọchịchị dị. Cheta n'izuụka gara aga, ndị uweojii gara kpọchie ogige ebe Soyinka na ndị chọrọ inwe mkparịtaụka maka ọchịọchi. Ihe idemmiri na-eme n'Enugwu Ndị bị na obodo Eke Obinagu Emene dị n'Enugwu Steeti etiela mkpu n'oke olu maka ike idemmiri na-akpa n'obodo ha. Ha kwuru na ọ bụ n'ihi enweghi ezi ntọala ọwa mmiri mere idemmiri ji anyụ ha ịkpakwụ. Na mba ọzọ Mba Saụt Afrịka akpachiela ụgbọelu mba Tanzania dịka gọọmentị mba Tanzania si kwuo. Saụt Afrịka ekwubeghi okwu banyere nke a mana otu nwoke larala ezumike nka n'ọrụ ugbo sị na ọ bụ maka ego dị nde dọla iri atọ na atọ gọọmentị Tanzania ji ya n'ụgwọ butere mkpachi ahụ. N'egwuregwu Ndị mmadụ sị ka ha kpọgbuo Marcus Rashford na-agbara Manchester United bọọlụ n'iyi maka ịta penariti n'asọmpi ha na ndị Crystal Palace meriri ha. Rashord na Paul Pogba bụ ndị Manchester United abụọ akpọrọla iyi na soshal midia n'ime otu izuụka. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị: Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba." afirika-52724616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52724616,Maurice Iwu: Ọ ka mma ịgbalahụ coronavirus site na iri nri ga-echedo ahụ gị,Ọkammụta n'ihe gbasara ọgwụ e si na mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ emepụta bụ Maurice Iwu ekwuola na ọ ka mma mmadụ ichedo ahụ ya ka ọghara inweta ọrịa coronavirus.,"Iwu, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Tuzde, kwuru na-etu enweghị ọgwụ azụzụ, na-enweghị ọgwụ nje 'coronavirus' ugbua, ""ọ bụ etu isi chekwata onwe gị site n'iri ezi nri."" O kwuru na nri dịka ""ji mmiri ọkụ e ji ụtazi na ose sie ya, ị nụọ ya, ya agbasie gị ahụ."" O kwukwara na ugu, onugbu nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ dị mkpa. N'okwu ọgwụ ọgwụgwọ coronavirus Iwu sị na e nwere ihe atọ dị n'ala Igbo e were ike inye aka ịgwọ ọrịa coronavirus. O kwuru n'ụfọdụ ihe ndị a bụ ihe dị n'ọgwụ ahụ o mepụtara nke a na-atụlee ma aga-anabata maka ọgwụgwọ coronavirus. N'okwu ihe mere gọọmenti etiti ji gbahapụ ọgwụ Maurice Iwu ga were nke ndị mba Madagascar, Iwu kwuru na onye na-azụ ahịa bụ nke masịrị ya ka ọ ga-azụ. Lekwa ihe ndị ọzọ di mkpa o kwuru:" afirika-53851855,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53851855,Nnamdi Kanụ: Otu onye enweghị ikike ịgbanwe ọkọlọtọ Biafra - Massob,"Ọnụ na-ekwuru otu ọzọ na-achọ Biafra bụ nke Bekee kpọrọ 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob)' bụ Comrade Samuel Edeson, ekwuola na ihazigharị Ọkọlọtọ Biafra ""abụghị okwu otu onye ga-ebi.""","Nnamdị Kanu gbanwere ọkọlọtọ Bịafra tinye ya 'Kpakpando nke David.' Comrade Edeson sị: ""Biafra abụghị ihe otu onye ga-ekuli n'ụra, ọ gbanwe Ọkọlọtọ e ji mara Biafra. Ọ bụ ihe kwesiri na ndị Bekee kpọrọ 'stakeholders' ga-anọ were kpaa maka ya."" Edeson jụrụ sị, ""Ya bụ ihe o mere, kedụ ndị ya na ya kpara ya tupu ya mee ya? Ka o mere ya n'aha Ipob, kaa ọ bụ na ndị Bịafra kwekọrịtara mee ya?"" ""A ka ga-eleba ya anya maọbụrụ na ndị Igbo nabata, ndị Biafra anabata ya, anyị ewere."" O kwuru na Biafra Massob na-ele anya ya bụ ebe onye nwere ikike okpukperechi masiri ya, ikike onye ikwu uche ya, na ọ bụghị nke onye ga-kwuo uche ya, akpọwa ya iyi. Gee ihe Edeson kwuru n'uju: Samuel Edeson: Nnamdi Kanu enweghị ikike ịgbanwe Ọkọlọtọ Biafra Oge BBC Igbo kpọrọ Ralph Uwazuruike bụ onye ndu otu Biafra Indepedence Movement (Bim) n'ekwentị ịnụta echiche ya banyere ọkọlọtọ ọhụrụ a Kanu wepụtara, o kwuru na ya agaghị asa ya bụ ajụjụ. Nnamdi Kanu, onye ndu otu Ipob Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-agba mbọ maka ikewa Naijirịa jiri nwete mba ha kpọrọ Bịafra bụ nke Bekee kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), akọwaala ihe mere o ji gbanwee ọkọlọtọ ndị hibere mba Biafra mere. Na nkọwa ya, Kanu sị na ọ bụ naanị ""Kpakpando nke David bụ ihe ndị Briten chịkọtara Naijiria tinyere n'ọkọlọta ha bụ ihe na-egosi njirimara ndị Igbo"". Kanụ, onye gara n'ihu kwuo na ha 'agaghị agbanwe njirimara 'Coat of Arm'. O kwukwara na ndị na-akatọ ọkọlọtọ ahụ na-ekwu na ha abụghị ndị Juu, maọbụ na-asị na ya chọrọ ịmanye ha ịbụ ndị Juu' bụ enweghị nghọta zuru oke na-enye ha nsogbu. Okoloto Kanu weputere na nke Biafra wepụtere n'oge mba ahụ pụtara Ọkọlọtọ Bịafra bụ akwa nwere uhie ọbaraọbara, ojii na ndụndụ nke eserese anyanwụ n'awapụta awapụta nọ n'etiti ya. N'ozi ọ gbasara n'ikuku n'abalị Wenezde, Nnamdi Kanụ kwuru na ""ọ bụghị m wepụtara akara ọkọlọtọ, mana anyị tinyere 'Kpakpando nke David' dị na ya,"". Ọ gara n'ihu kwuo na ọkọlọtọ ahụ na-egosi ntọala ebe ndị Igbo si. O kwuru na ""Onye ọbụla nke jụrụ ọkọlọtọ ọhụrụ a ""ị mara na o nwere Ekwensu n'ime ya."" Ebe ka Ọkọlotọ Biafra si? Generalụ Emeka Ojukwu dịka ọ kwụ n'ihu ọkọlọtọ Biafra n'oge Biafra Dịka websaitị 'Flags of the World' (FOTW) si kwuo, ọkọlọtọ Bịafra malitere n'abalị iri atọ nke ọnwa Mee afọ 1967 ya nke e ṅomiri nhazi ọkọlọtọ nke otu 'Universal Negro Improvement Association and African Communities League bụ otu 'Marcus Harvey malitere. Ya bụ ọkọlọtọ bụ ihe ndị otu Massob nke Uwazuruike bụbu onye ndu ha wepụtara oge ọ malitere ịgba mbọ maka nnwereonwe Biafra. Otu Ipob jikwara ya bụ ọkọlọtọ Biafra mere njirimara ha wee ruo ụbọchị Wenezde mgbe Kanu mara ọkwa na ha emegharịala ya bụ okọlotọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48796806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48796806,Ihedioha vs Okorocha: Ọ gịnị n'afịọ n'Imo steeti?,"Ndị a na-eche na ha na-agara gọọmentị Imo steeti ozi n'okpuru ngalaba akpọrọ ""Imo State Task Force on Recovery of Government Assets"" wakporo ụlọ ahịa akpọrọ House of Freeda n'Owere ụnyaahụ.","Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti Ụlọ ahịa a awakporo bụ nke nwa aka chịbụrụ steeti ahụ bụ Rochas Okorocha. Ihe a mere ka omere otu ụbọchị ngalaba ahụ wepụtara ebubo na gọọmentị Rochas Okorochaa zuru ụgbọala 67 na akụnaụba ndị ọzọ mgbe ha na-ala. Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam Onwụemedo gwara BBC Igbo na ndị bịara ije n'ụlọ ahịa nwa Okorocha ji ngwa ọgụ. Ọ gakwara n'ihu sị na ndị bụkọrọ akụnaụba na ego nke ọ sị na ha ka na-enyocha ịmata ole ọ dị. Mana, onye ntaakụkọ BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na ya so ngalaba ahụ gaa ọrụ n'ulọ ọrụ akpọrọ ""Ministry of Happiness"" nke nwanne Okorocha bụbụ onyeisi ya. Onyue ntaakụkọ ahụ achọghi ka ekwuo aha ya sị: ""Onweghi ihe fọrọ ebe ahụ. Ma akwa mpio, ebukọrọ ha laa."" Maazị Onwuemedo sị na ọ bụ gọọmentị Imo ka ọdịrị edepụte ihe ha sị na-efu na ebe ọ na-efu. Ọ sị na njem ngalaba nnakọta akụnaụba a gara bụ imegide ndị onweghị ihe ha mere. Na sọcial media, ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu a. Ugo Ebujo bụ onye ọkaiwu sị na gọọmentị Ihedioha si ka ekpe Okorochga ikpe ma ka agharị iji ndị akpụ obi ga ya bụ ije. FCC Jones bụbụ ọnụ na-ekwuru Uche Nwosu - bụ onye ọ bu ụlọ ahịa nwunnye ya ka awakporo - sị na adabaghị ị na-emegide azụmahịa ma na-achọ ka ndị mmadu bubata ego na steeti ahụ. Achiever Darlington Uchenna Onyelike nyere onyeisi ngalaba nnakọta a bụ Jasper Ndubaku ezigbote ekele. BBC Igbo gbaliri ịnwete Jasper Ndubaku n'ekwenti mana nke ya gbanyụrụ agbanyụ. Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na steeti ahụ bụ Godson Orlando Ikeokwu asaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ. Akụkọ a ka dị n'ekwu. Anyị ka na-achọ ntụbịrịkọ ya." afirika-44909831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44909831,Esemokwu 'African Queen': Ihe ndị mmadụ na-ekwu,Esemokwu dị n'etiti ndị otiegwu abụọ bụ Tuface na Blackface amalitela ọzọ.,"Ka ọ dị ugbua, Innocent Idibia a ma dịka 'Tuface', akpụpụla onye otiegwu ibe ya bụ Augustine Ahmedu, ụlọịkpe maka ihe gbasara egwu 'African Queen' ha abụọ dekọrọ kemgbe afọ 2004. Blackface bụ onye gosiri akwụkwọ ahụ Tuface na onyeisi ụlọọrụ egwu ya bụ Efe Omoregbe gbara ya n'ụlọikpe, n'elu akara Instagram ya. End of Instagram post, 1 Akwụkwọ Tuface gbara Blackface bụ maka mmetọ aha ya, ruru nde naịra iri ise. Nke a emeela ka ndị mmadụ pụta n'elu soshal midia ịrịọ tuface ka ọ gbaghara Blackface. @ED_daps kwunyeere Tuface n'azụ, sị ya gaa n'ihu gbaa Blackface akwụkwọ: @Ose-wavez chetaara Tuface na Blackface enweghi ụdịrị ego ahụ. @ChinnyPillz kwuru na Tuface ekwesịghi ịgba Blackface akwụkwọ ebe ọ ma na o nweghị ụdịrị ego ahụ. @Bayotweets101 na-arịọ Tuface ya biko meere Blackface ebere. Efe Omoregbe gwara BBC na o teela aka Blackface na-erite ihe kwesịrị ya site n'egwu 'African Queen' ha abụọ dekọrọ n'afọ 2004." afirika-46417212,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46417212,Nigerian Police: Ndị uweojii 2000 na-aga agha Boko Haram,Akụkọ ndị kacha mkpa: Ndị Uweojii ga -aga agha ndị Ọmekataraihepụụjọ,"Ndí uweojii Naíjiría akwadola ílúsa ndí Omeketereihepúújó agha Onyeisi ndị uweojii ekwuola na ha ga-etinye ndị ọrụ ha rụru puku abụọ ọzọ n'ọrụ ibuso ndị ọmekereihepụụjọ bụ Boko Haram agha na ọdịdaanyanwụ nke ugwu awụsa. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh Moshood gbara ama a n'ụbọchị ọka n'isi ụlọọrụ ha n'Abuja. End of Twitter post, 1 Ihe Charlie Boy gwara Gọọmentị etiti Onye nchịkọta Our Mumu Don Do bụ Charlie Boy Oputa ekwuola na ntuliaka 2019 apụghị imezu ma ọgbaghara na-ada na mpaghara Naịjirịa niile diri gawa. Charlie Boy kwuru nke a mgbe ha mere ngagharị udo n'ụzọ Isolo nke Legos steeti bụ ebe ọ nọ gwa gọmenti ka ha jisike bịe ọgbaghara niile ndị a tupu ya bụ ntuliaka eruo. Ndị ahịa mmanụ ụgbọala adọọla gọọmentị aka na ntị Ndị ahị mmanụ ụgbọala akwadowela ịgba arụkwaghị Ndị ahịa mmanụ ụgbọla na Naịjirịa adọọla gọọmenti etiti aka na ntị ka ha gbaa mbọ kwụọ ha ụgwọ eji ha nke ruru ijeri narị naira asatọ (N800b). Okaiwe ndị otu a bụ Patrick Etim kwụrụ na emeghị otu a n'ụbọchị asaa na abịa ga-eme ga-eme ka ndị otu ha wụsa ọwara na Naịjịrịa gbaa gburu gburu. N'ofesi Emmanuel Macron na ndí órú ya Ihe ruru mmadụ atọ anwụọla na ngagharị iwe n'eme an mba France maka ego mmanụ ụgbọla rịri elu. Onyeisi mba ahụ bụ Emmanuel Marcon nọ n'isi oche nzụkọ ọtawaike ihụ ka aga esị nwete ya bụ ọgbaghara nke ọtụtụ mmadụ merụgoro ahụ na ngwucha. N'egwuregwu Chelsea na Fulham N'egwuruegwu, chelsea ewerela ọkpụ abụọ nyụọ ndị Fulham ịkpakwụ ebe Arsenal ji ọkpụ anọ asatara abụọ gbara isi onwe n'aka Tottenham n'asọmmpị Premier lig. Ọzọ, ndị otu Super Falcons awụchiela na ọdọ ụgbụọle Abuja ka buchere iko AWCON na ụbọchị Satọde. Gee nkeji BBC Igbo mgbede Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Lee emume iri ji ndị Arochukwu Wepụ ego mgbakwụnye mmanụ Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ACPN bụ Oby Ezekwesili akpọọla oku ka gọọmenti kwụsị ego mgbakwụnye ha na-akwụ na mmanụ ụgbọala nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee. Ezekwesili, onye kwuru nke a na akwụkwọozi o wepụtara kwuru na kama ịkwụ ihe karịrị otu tari naira nke e nweghị ọ na-abara ndị obere mmadụ, ọ ga-aka mma ịhaziharị ngalaba mmanụ ka a na-ere mmanụ ihe ọ na-ada n'ahịa. Naijiria kachasị nwe ụmụada erughị eru lụọ di Otu United Nations ekwuola na Nigeria bụ mba kachasị nwe ụmụada akpọnyere di na erughị eru dịka e nwere ụmụada nde iri abụọ na atọ a lụrụ na nwata. Onye ọrụ mgbasasaozi otu UN bụ Dkta Seyi Soremekun kwupụtara nke n'akwụkwọ si o depụtara ụbọchị Satode kwuru na ọ bụrụ na egbochighị ya, n'afọ iri na-abịa, a ga na-enwe ụmụada erughị afọ iri na asatọ karịrị puku iri na anọ a ga na-eke di kwa afọ. Nwaneku atọrọla ụmụaka abụọ na Legọs Otu nwaneku atọrọla ụmụaka abụọ ọ na na-eleta na Legọs. Ka o mechara abalị asatọ e jiri were ya n'ọlụ, nwaneku a kpọrọ Busayo gara n'ụlọ akwụkwọ ụbọchị Fraide tọrọ ụmụaka nne ya ukwu abụọ gbafuo, ebe ekwenti ya gbanyụrụ agbanyụ kemgbe ahụ. Mba Amerịka na China N'ofesi, mba Amerika na Japan ekpebiela na ha ga-ejide ume ha ọnwa atọ n'ebumnobi ha ijikọta ma bulie ụgwọ isi ha na-ana na ṅgwaahịa sị mba China, ebe China na-ekwe nkwa ị na-atụbata ngwaahịa dịka ihe ubi na akọrọọngwa ụlọọrụ sị Amerịka. CAF: Oparanozie,Oshola aagahị eso N'egwuregwu, Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekelela ndi otu egwu bọọlụ Super Falcon maka ibuli iko AWCON ebe ha ji ọkpụ anọ asatara otu merie mba Saut Afrika n'asompi e mere ụbọchị Satọde. Buhari tokwara ndị nchikọta otu egwu bọọlụ ahụ, ndị nkwado ha nakwa ụmụ Naijiria niile maka mmeri ahụ nke bụ nke itoolu n'ime agba iri na otu e merela asompi egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyị Afrika. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" egwuregwu-47518524,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47518524,Arsenal vs Man United: Ụwa niile ahụla ọtọ Man Utd taa,Ndị Man Utd riri aja nsuru ọkụ n'aka otu Arsenal ka ha bịara 'ileta' ha n'ụlọ ha n'Emirates.,"Goolu abụọ Granit Xhaka nyere n'ime nkeji 12 e ji bido bọọlụ na nke Pierre-Emerick Aubameyang nyere na nkeji 69, zuru ịtụnye Man Utd n'ime ala, wụkwasị ha aja ụrọ. Enwere oge Romelu Lukaku riwara ọnụ n'ihu poostu ndị Arsenal, n'ime ọkara nke mbụ. Nke a bụ mmeri mbụ a na-emeri Ole Gunnar Solskjaer na Premier League kemgbe o ji malite ịchịkọta Man Utd. Mmeri a emeela ka Tottenham nọ n'ọkwa atọ jiri naanị otu pọintị agafe Arsenal, ebe Arsenal rịferela Man Utd na tebulu Premier League. Ajụjụ bụzị ""Arsenal ọ ga-anọ n'ọkwa anọ nke mbụ mgbe afọ a ga-agwụ?""" afirika-48928762,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48928762,UNN Electric Car: 'Ọ bụrụ na ọkụ na akụrụnkwa dị anyị kaara ime karịa',Onyendu ndị mepụtara ụgbọala latrik na Mahadum Nsukka akọwala ka ha na ije si gaa.,"BBC Igbo na ndị rụpụtara ụgbọala latrik na ngalaba injiniarịn nke Mahadum Nsukka bụ 'Univerisity of Nigeria Nsukka' (UNN) nwere mkparịtaụka maka ya bụ ụgbọala latrik ha rụrụpụtara. Ọkammụta bụ onye ya na ndị nchọpụta ụmụakwụkwọ dị n'aka bụ Injinịa Ozoemena Ani sị na ọkụ na enweghị akụrụngwa ọgbaraọhụrụ bụ ihe cheere ha aka mgba. Ani sị na ọ bụ otu n'ime ndị ọgbakọ ndị nchọpụta na ngalaba nke 'Mechatronics' bụ ihe meputara ya bụ ụgbọala site na nkwado onye bụbu onyeisi ya bụ Mahadum bụ D C Ozumba, Ọ sị na ụzọ asatọ n'ime iri n'akụrụngwa eji rụọ ya bụ ụgbọala sị na Ala Igbo dịka Onisha, Nnewi na Nsukka. Ani sị na ""anyị ji izuụka ịnọ rụọ ya bụ ụgbọala"". Ọ sị na ịrụpụta ya bụ ụgbọala gbadoroụkwụ n'oku ndị National Automotive Design and Development Council (NADDC) kpọrọ Mahadum anọ n'Abuja. Ya bụ oku mere Onyeisi Mahadum nke lara ezumike nke bụ D C Ozumba jiri nye ya bụ nkwado. Ha rịọrịọ ka gọmenti nye nkwado ga-eme ka arụwa ya bụ ụgbọala ka ọ ga-agbate aka n'okporo ụzọ. Ụgbọala ọkụ latrik na-enye ọkụ nke mahadum 'Univerisity of Nigeria Nsukka' (UNN) rụpụtara Dika Ani kwuru, ""ụnyahụ anyị nyagharịrị ya bụ ụgbọala, onyeisi Mahadum anyị nke ochie bụ Ozumba nọ n'ihu, Onyeisi ndị NADDC na ọnye otu ya nọ n'azụ, Onyeisi Mahadum UNN ọhụrụ bụ nọkwa n'azụ. Mmadụ ise nọ na ya bụ ụgbụọla otu mgbe."" Ani kwusiri ike na ọkụ latrik bụ ihe kacha chee ha aka mgba na ya bụ ọrụ nke bụ na ha arụchaghị ya bụ ụgbọala n'ime ya bụ Mahadum mana ọ bụ n'ụlọọrụ ndị ọzọ ka ha rụchara ya. ""Anyị rụrụ ya bụ ụgbụala ka ọgbawa ihe dịka kilometa iri atọ n'otu awa ma o buru mmadụ anọ. O burukwa mmadụ abụọ, ọ ga-agbafe nke a"". Ani kwuru na aga eji awa atọ mee ka afọ ju batiri ya bụ gbọala na ha nwekwara olile anya na ha ga-arụnye ya ihe nke ga-eme ka ejiri ike dị n'anyanwụ na-anya ya. Ọ sịkwa na nchọcha ka na-aga n'ihu na ya bụ ụgbọala nke o kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ n'ime isi abụọ na asaa bụ ndị bụ isi sekpụ ntị na ya bụ ọrụ. Ndị a bụ ndị aka ha dị na ya bụ ọrụ: Ndị ọnụ na-eru n'okwu jakwara Mahadum a maka ọrụ. Lee ihe nkiri maka Keke latrik Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi Akụkọ ga-amsị gị" 49014293,https://www.bbc.com/igbo/49014293,"Northern Coalition to Fulani herdsmen: 'Lọtanụ, hapụnụ Ndịda Naijiria'","Otu Ohanaeze, Ipob nakwa otu Njikọ Igbo ekwuola na ha anaghị achụla ndị Fulani na-achị ehi kama ha chọọ ịla, ha lawa.","Ha kwuru na ihe ndị Igbo achọghị bụ ndị na-eme mpụ; ndị ntọ, ndị ohi, ndị na-awakpo ụmụnwaanyị n'ike nakwa ndị na-emebi ugbo. Okwu a bụ n'ọsịsa oku nke otu jịkọrọ ndị okenye na ndị ntorobia ndị Ugwu kpọrọ ụbọchị Tuzde ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Ọdịda Naijiria lọghachi Ugwu Awụsa. Otu Ohaneze kwuru na oku ahụ ""jọgburu onwe ya"", sị na o nweghị onye Ndigbo sịrị ya lawa karịa ndị na-eme mpụ dịka ịtọ nakwa igbu mmadụ maọbụ izu ohi. Ha rụtụrụ aka na ọ bụ mmadụ ole na ole enweghị ndị họpụtara ha ji aka ha na-etinye ọgbaghara. Ọnụ na-ekwuru Ohanaeze bụ Chuks Ilegbu sị,""O nweghị onye Ndigbo sị ya lawa. O nweghị onye na-achụ onye ọbụla. Ọ bụ ndị Ugwu nọ na-ekwuru onwe ha."" ""O nweghị onye Ndigbo sị ya lawa, mana onye ọbụla na-eme mpụ; onye ntọ, onye na-egbu mmadụ, aka ga-akpara ya."" Ihe Ipob kwuru Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na ""Ezinaụlọ Ipob n'ụwa niile nabatara mkpebi ndị ndu Fulani ịkpọghachị ndị nke ha."" ""Obi anyị na mkpebi anyị nọ na Ndịda agbanweela na-enweghị nlaghachị azụ; Ịtọgahpụ ndị a na-akpagbu."" Na mgbakwunye, ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Rev Peace Chukwudi, sị na ""Anyị asịghị ha lawa mana anyị nabatara ya nke ọma. Ọ bụ ezigbote ihe, bụrụ ihe kwesịrị na ha kwaara ihe ha pụọ."" O kwukwara na ọ ga-amasị otu Ipob na ndị ọchịehi ga-eme ihe ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ ha ka ha na-ebu ehi ha n'ụgbọala kama ị na-achị ya na-agagharị."" Ihe Njikọ Igbo tụnyere n'okwu ahụ. Okechukwu Obioha bụ onye isi otu Njikọ Igbo N'okwu ya, onyeisi Njikọ Igbo bụ Rev Okechukwu Obiora kwuru na ""ọ bụghị isi n'ọnụma na iwe, ngwa lọtawanụ, ha chọkwaa ịla, ha lawa."" Obioha kwuru na ""Ọ ka mma ndị ndu ahụ isi n'otu Miyetti Allah gwa ha ka ha ghara ị na-emenina ndị ha nọ be ha akpa ehi."" Otu Northern Elders Forum (NEF) na otu 'Coalition of the Northern Groups' boro ebubo na ndị ndu Ndịda Naịjiria gụnyere ndị gọvanọ ha majara ndị Fulani ọchịehi sị na-ha ga-ebuso ha agha. Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n'Abuja ụbọchị Tuzde, kwuru na ndị ndu ndị Ọdịda-Anyanwụ na-amaja ha, na ha ejighị ndụ ha aka. Ango Abdullahi, onye kwadoro ihe ndị otu a kwuru sị ""Obi na-akụja anyị na ọ bụụ na ndu ha koro n'elu, ọ ga aka mma na ha lọtara ebe ndụ ha ga-enwe nchekwa. Ndụ ha ka mkpa karịa ebe ha nọ."" N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru otu 'Coalition of Northern Groups' bụ Abdul-Aziz Sulaiman sịrị na gọọmenti ugbua kemgbe afọ anọ achọghị iwepụta amụma ga-akwụsị nsogbu ndị ọchịehi maọbụ mee ihe ọbụla banyere ndị Fulani a na-awakpo na steeti dị icheiche."" Cheta na mgbaha sochiri atụmatụ Ruga nke gọọmenti etiti tụpụtara iji nye ndị ọchịehi ala na steeti dị iche iche dị na Naijiria. Ọzọ dịka ibe ya bụkwa ọnwụ Funke Olakurin, nwa otu n'ime ndị ndu otu Afenifere bụ Reuben Fashoranti nke ụfọdụ na-ebo ebubo na ọ bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ya. Prof Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ Ọtụtụ steeti dị na Ọwụwa-Anyanwụ na Ọdịda ya jụrụ iwepụta ala, sị na ha achọghị ya. Akụkọ ga-amasị:" afirika-47222782,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47222782,Nigeria Elections 2019: Nkwado ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ ebirila ọkụ,"Ntuliaka ọkwa onyeisiala na nke ụlọomeiwu fọrọ naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ, kedụ ka eke si anya anwụ n'ọwụwa anyanwụ?","Ndị ntaakụkọ BBC Igbo wuchiri ụlọọrụ ndị Inec nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ịgba anya tọọchị, wee hụ etu ha si akwado maka ntuliaka a. Ihe anyị hụrụ: N'Abịa steeti: Ụlọọrụ Inec nke Abia Steeti na-eke ajị n'ume maka ntuliaka ga-adị na Satọde. Otu onye ọrụ Inec na-arụ na ngalaba technuzu aha ya bụ Ugochukwu Nwokorie, gwara BBC Igbo na ha akwadola igwe kaadị rida, igbe ntuliaka nakwa ihe ndị ọzọ dika o kwesịrị ịdị ma gụkọọ ya na wọọdụ na wọọdụ. O kwuru na e meecha nke a, na ha ga-ezipu ngwaọrụ ndị a gaa okpuruọchịchị dị iche iche n'Abia Steeti. N'Anambara steeti: Ndị ụlọọrụ Inec n'Anambara kwuru na ha anatala ngwaọrụ mafere ofe si n'ihe karịrị steeti asaa. Onyeisi ụlọọrụ Inec nke Anambara Steeti, bụ Dọkịnta Nkwachukwu Oji, dụrụ ndị niile tozuru ịtụ vootu n'Anambara Steeti ọdụ ka ha jikere maka nke a n'ihi na egwu adịghị. Cheta na ọkụ gbara ụlọọrụ ha, ebe ha dọwara nke e kenyeburu ha, n'ụbọchị 12 nke ọnwa Febrụwarị a, mana Inec kwuru na ntuliaka ga-aga n'ihu. Ndị ụlọọrụ Inec, ndị gụnyere ndị ji otu afọ efe ala nna ha ka a hụrụ ebe ha na-enye aka ihazi igwe e ji enyocha akwụkwọ e ji atụ vootu bụ 'Card Readers', n'Anambara Steeti Ha nwetara ngawọrụ gụnyere igwe kaadị rida e ji eme ntuliaka, akwụkwọ mbinyeaka na ihe ndị ọzọ. Ha na-eme nyocha igwe e ji eme ntuliaka Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51444921,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51444921,Africa Eye: Etu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa si eji 'tabay torture' ata ndị mmadụ ahụhụ,Ịdọ aka na ntị: Ihe onyonyo a gosiri ihe ntaramahụhụ dị icheiche.,"BBC Arican Eye mere nnyochapụta pụrụ iche nke gosiri na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-eji ọtụtụ ụzọ ntaramahụhụ emekpa ndị mmadụ ahụ. Iwu Naịjirịa megidere ịta mmadụ ahụhụ, mana usoro ntaramahụhụ a kprọrọ 'tabay' bụ nke ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ejikarị emenyụ ndị mmadụ anya. Nnyochapụta gosiri ebe 'tabayi si malite ma gosikwa ndị kacha eji ya ata ndị mmadụ ahụhụ. Anyị chọpụtakwara na otu onyeisi ndị uweojii ji ụzọ dị otu a taa otu nwata ahụhụ n'afọ 2014. Onye e ji 'tabay torture ata ahụhụ Nwata nwoke ahụ mechara nwụọ n'ihi ahụ o merụrụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47038730,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47038730,IPOB: Ụmụ Biafra kwadonu Referandum na Feb.16,Onye ndu Ipob ekwuola na ndi otu ya ga-eme ntuliaka 'referedum' n'ọnwa Februwarị iri na isii.,"Kanu kwuru na ntuliaka a ga-eme ka ha mara ndị chọrọ ndọrọndọrọ Naịjirịa maọbụ nwereonwe Biafra site na atụmaatụ n'enweghị ntụpọ emere n'udo. Akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere IPOB ọnụ bụ Emma Powerful depụtara kwuru na Kanu esila mba Israel ga mba Uk ihazị ihe niile gbasara 'Referendum' a. O kwuru na IPOB ga-eme ya bụ ntụliaka ụbọchị a ga-eme ntụliaka ịchọpụta onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa bụ Februwarị iri na isii. Akwụkwọ ahụ kwụkwara na Kanu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na mba ofesi na-enwe mkparịtaụka maka etu Referendum ga-esi gaa nke ọma. Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa ekwuputela uche ha gbasara mkpebi a Kanu mere. Onye ụlọrụ Inec bụ Nnenna Okoronkwo kwuru na ọ bụ sọsọ ntuliaka onyeisiala ka Inec ma ga-eme ụbọchị Februwarị iri na isii. N'okwu ya, ọ bụrụ na o nwere ihe ga-agbanwe, Inec ga-eme ka ụmụ Naịjirịa mara. N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere Ohaneze Ndigbo bụ Chuks Iloegbunam kwuru na e nwere usoro eji eme ""Referendum"". Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ O kwuru na ya bụ mkpebi gosiri na obi adịghị ndị otu Ipob mma ma na-ekwu na ha nwere ikike ịchọta ihe ha na-achọ dịka Ohaneze Ndịgbo na-achọ nhazigharị obodo. Onye na-ekwuchitere pati APC na Lagos bụ Joe Igbokwe kwuru na Nnmadi Kanu enweghị ikike ịnọ na mba ọzọ na-gwa gọọmenti etiti ihe ga-eme n'ala Naịjirịa. O chetaara Kanu etu agha Biafra si mebie ọtụtụ ihe , ma na-aju ya ebe ọ nọ mgbe a lụrụ ya bụ agha. Igbokwe kwuru ka a napụ Kanu igwe eji ekwu okwu makana o ga-eme ka ọ kwụsị ị na-akọgheri akọgheri. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkpebi a na soshal midia: @interpocf86 kwuru na Nnamdi Kanu enweghị ike ị nọ n'ala onyeọzọ na hazi 'Referendum'. @Onyeabuo kwuru na okwu Kanu atala nchara. Ebe ‏@preciousakande kwuru na ọ chọrọ ka Naịjirịa kewaa n'afọ a maọbụ Buhari na Atiku achịwa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46736955,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46736955,2019 Election Campaign: Aisha Buhari o loola ọnụmmiri okwu ya?,Ihe mgbagwoju emeela dịka nwunye onyeisiala nabatara ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka onyeisioche ga-ahụ maka achụmnta vootu di ya na ngalaba ụmụnwaanyị.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Nke a bụ n'ihi na mkparịtaụka ya na BBC ngalaba nke Awusa nwere n'afọ 2016, Aisha Buhari gbara ama na ya agaghị eso di ya chụọ nta vootu ma ọ bụ na ọ chọọ ịzọ ọkwa ọzọ. Mana ọnụ na-ekwuru nwunye onyeisiala bụ Suleiman Haruna gọrọ na o nweghị mgbe ọbụla Aisha Buhari jiri kwuo na ya agaghị akwado achụmnta vootu di ya. Oge BBC Igbo gara n'ihu imekwu nchọpụta maka okwu a, Maazị Haruna riri mbọmbọ ma kwuo na ya enwechaghị oge iji zaa ajụjụ a. Nwunye onyeisiala mechakwara kwuo na-enwere ndị mmadụ ole na ole nọ n'obi ọchịchị Naijiria, bụ ndị na-chị obodo a n'aha di ya bụ Muhammadụ Buharị. N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ya site n'ekwe ntị, okwupụta okwụ nke otu Pati PDP bụ Maazị Kọla Ọlọgbọndiyan, gosipụtara mgbagwoju anya n'ihe nwunye onyeisiala ga-agwa ndị Naijiria bụ ndị ọgwaburu n'oge mbụ na onwere ndị ji aha di ya achị ala Naijiria. Na ntụnye nke ya, onye e ji okwu ya agba izu n'okwu gbasara ọhaneze bụ, Maazị Chukwunọnye Okereke, kwuru na agwa a nwunye onyeisisala kpara gosipụtara na ọ na-erube isi, ma na-anọgidesị ike n'okpuru di ya mgbe niile, na-agbanyeghị ihe ọbụla. Onye ga-esokwa n'isi oche achụmnta vootu a dịka ozi si n'aka okwupụta okwu nwunye onyeisiala siri dị, ga-abụ nwunye osote onyeisiala Naijiria bụ Oriakụ Dọlapọ Osinbajọ. Ndị ọzọ ga-anọ n'okpuru achụmnta vootu a, dịka akwụkwọ akụkọ Daily Trust siri dee, bụ mmadụ ruru narị asaa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48628106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48628106,Unmarried women: Nwaanyị alụghị di ọ ka ogbo ya lụrụ di enwe aṅụrị?,Otu ọkammụta a kpọrọ Paul Dolan kwuru na nchọpụta ha mere na nsonso na-egosi na ụmụnwaanyị alụghị di kachasị enwe anụrị n'ime mmadu niile.,"Kedụ onye ka enwe aṅụrị: Nwaanyị alụghị di ka ọ bụ nwaanyị nọ na di O kwuru na ihe akaebe na-egosi na nwekwara ike ibi ogologo ndụ karịa ogbo ha ndị lụụ di ma mụta ụmụ. Dolan onye bụ ọkammụta na Sayensi agwammadụ na London School of Economics alụmdi na-aka a bara ụmụnwoke n'ihi na ọ na-eme ka ""isi jụọ ha oyi."" ""Ha na-akwụsị ịkpa aghara nwere ike ibutere ha nsogbu, ma bido tinye uchu n'ọrụ ha iji kpata ego."" ""Mana nwaanyị, ga na-edi ọtụtụ ihe, o nwere ike nwụọ ọsịsọ karịa ndị ọgbọ ya alụbeghị di."" Dolan onye gbakwasara ụkwụ na nchọpụta 'the American Time Use Survey' gara n'ihu kwuo na ndị kachasị nwee ahụike ma ka na-enwe aṅụrị bụ ụmụnwaanyị ndị na-alụghị di maọbụ mụta nwa."" Ihe ụmụ nwaanyị Naijiria na-ekwu maka ya Mana ụmụnwaanyị ndị Naijria kwuru na ọ bụghị ka akụ ilu sị ada ka o si atọọ. Ha kwuru na ka ọnọdụ onye sị dị ga-ekwu ma ọ ga na-enwe aṅụrị na ọ bụghị alụmdi maọbụ alụghị alụ. Omagha Grace, alụbeghị di Ọ gbara ama na o nwere oge owu ọmụma na-eji onye alubeghị di, nke nwere ike ime ya obi adịghị mma. Mana n'uche ya, ""ọ bụrụ na ị lụbeghị di mana ị mara ebe ị na-aga, ị ga na-enwe aṅ ri."" ""Ị ga-enwe ohere ime ihe ị chọrọ ime na enweghị mkpachi."" ""Ọ bụrụ na ịlụ onye hụrụ gị n'anya ma na-akwado ihe ị na-eme, ị ga-enwe aṅụrị."" ""Aṅụrị abụghị ihe ịlụ di maọbụ alụghị di na-eweta."" Chidinma Njoku alụọla di mụta ụmụ Chidinma Njoku kwuru na o nweghị onye ka ibe ya enwe aṅụrị n'etiti onye lụụ di na onye alụbeghị n'ihi na dịka o siri kọwaa, ihe niile nwere oge. "" Mgbe m alụbeghị di, mgbe sọrọ m arahụ m, mgbe sọrọ m aga m pati."" "" Mana ugbua, mgbe ị chọrọ ịrahụ ụra ga-abụ oge ị ga-eji achụgharị nwaa ka ọ bịa saa ahụ maọbụ rie nri."" "" Ọ bụghị ma ị lụrụ di maọbụ na ịlụghị di. Onye nụtara ezigbo di ga na-enwe aṅụrị. "" Dkta Chioma Ofoekii alụbeghị di Chioma kwuru na ihe mere o jiri dịka nwaanyị anọghị na di ka nke nọ na ndị enwe anwụrị bụ na ọtụtụ ụmụnwoke n'ala Igbo anaghị ekwe enyere nwụnye aka n'ụlọ. ""Onye alụghị di nwere ike kwuo ihe ọ chọrọ ịrụ ma ruro ya n'isi , o nweghị onye ọ ga-anata ikike ịchụ ebumnobi ya."" ""Nwaanyị lụọ di, ọrụ isi nri, ịsụ akwa ma nke ya ma nke dị ya na-enwere oge ya."" ""O nweghị onye ga-enyere ya aka n'ihi na Ndigbo na-ahụ nwoke inyere nwunye ya aka dika ihe ọjọọ. Ha na-eme nwunye ha ka ha abụ ohu."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 48979769,https://www.bbc.com/igbo/48979769,Senegal vs Tunisia: Onye ga-ezute Senegal n'ikpeazụ Afcon?,Sịnịgal emeriela mba Tunishia iji ruo agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Mba Afrịka nke 2019.,"Mmeri a ha meriri site na goolu Dylan Bronn bụ onye mba Tunishia ji aka ya takpuo na neetị ha na nkeji 100, mere ka ha nwee ohere ịzọ ma lee ma aka ha a ga-emetụ Iko asọmpi a ma ncha. Nke a ga-eme ya naanị mkpụrụ ugboro abụọ Sịnịgala na-eru agba ngwụcha asọmpi a. Ihe tụrụ ndị mmadụ anya bụ etu mba abụọ a si richaa penariti a dọnyeere ha n'efere, mere ka egwuregwu ha banye agba ""gbaa ka anyị laa"" ebe e tinyekwuru ha nkeji 30. Ferjani Sassi nke Tunishia bu ụzọ rie na nkeji 75, ebe Henri Saivet nke Sịnịgal rịwakwara ndị be ha obi na nkeji 81. Ka anyị 'tụọ down' na mba Libya Ndị ụlọọrụ United Nations (UN) na-akpọ oku ka e mechie ebe ndị a na-etinye ndị gbara ọsọ ndụ, makana ọnọdụ ebe ahụ adịghị mma ịbụ ebe obibi nye ndị mbịarambịara. UN kwuru na ha dị njikere inyere ha aka wee na-elekọta ndị mbịarambịara a. Nke a na-abịa ka ihe karịrị mmadụ iri ise nwụrụ mgbe e si n'ụgbọelu tụsa mgbọ n'ebe a na-edowe ndị gbara ọsọ ndụ n'isiobodo Tripoli izu abụọ gara aga. Amnesty International na-ebo ndị uweojii Rivas steeti ebubo Ngalaba na-arụ ọrụ n'efu bụ Amnesty International ekwuola na ọ bụ ndị uweojii butere ọkụ gbagburu mmadụ iri anọ na asatọ n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Juun na Rivas steeti. N'akwụkwọ ozi ha zipuru, ha sị na ọ bụ ndị uweojii na-arụ n'Afam dị nso ebe okpo mmanụ na-ehi ehi malitere ịgba egbe ka a jụrụ inye ha aka azụ. Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha emechabeghi nyocha, nke bụ na ha agaghị ekwu ma ihe Amnesty International na-ekwu ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. A bịa n'egwuregwu, Novak Djokovic na Roger Federer na-achịpụ ya ugbua dịka ha na-azọ onye ga-emeri ma bulie iko Wimbledon nke afọ a. Federer merie, ọ ga-abụ Iko nke itoolu ya, ebe ọ ga-abụ nke ise ya ma Djokovic buru ya n'afọ gara aga merie. N'egwuruegwu, Naịjiria na Algeria ga-akwata n'agba ọkara-ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị Julaị 14, n'asọmcoza pi Afcon. Mmadụ abụọ ndị oji ego achụ ego ndị Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-enye ha puku dọla iri ise maka otu goolu ọbụla ha nyere ndị Algeria. Ọnwụ Elizabeth Ndubisi Chukwu Uju Ndubisi Chukwu Onye nnọchite anya Naịjria na Saụt Afrika bụ Godwin Adams ekwuola ka e nyonyekwuo anya n'okwu gbasara ọnwụ Elizabeth Ndubisi Chukwu bụ onye egburu n'obodo ahụ. Adams na-akọwata na mgbe ụfọdụ na ọ bụ ekewe eketeghị n'etiti ndị Naịjirịa ụfọdụ bụ ihe na-ebute ụdị ọnwụ ike a. Onye aka ya kwụọtọ ga a bụ onyenche obodo Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa Ọnụ na-ekwụrụ ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ekwuola na ọ bụ ndị aka ha dị ọcha ka ekwesiri ịnabata na ọrụ nchekwa ime obodo. Na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ, Frank kwuru na obodo ọbụla nwere ikike ịbido ndị otu nchekwa obodo nke ha ma ha soro usoro iwu kwuru. Ndi ogbu ara ọnara a hapụla iruuju, anyammiri na ọbara na Somalia N'ofesi, mmadụ iri abụọ na isii anwụọla na ogbunigwe na egbe ndị omekome gbara n'ụlọ oriri na nkwari dị na Kismayo, Somalia. Ndị ogbu ara ọbara kpọrọ onwe ha al-Shabab ji ya bụ arụrụala anya isi. Obasanjo sị na a ga-ahụ isi nsogbu nchekwa na Naịjirịa Obasanjo degaara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi toro ogologo iji sị ya azọla ọchịchị ọzọ n'afọ 2019 Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etinyeela ọnụ na nkatọ ogbugbu Funke Olakunrin bụ nwa onyeisi ndị Afenifere bụ Funke Olakunrin nke a na-eche na ndị ọchị ehi dị na ọnwụ ya. Obasanjo gwara gọmenti ka ha jisike jide ndị rụrụ ala ahụ taa ha ahụhụ dịka iwu kwuru. N'aka ọzọ, onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa na ndị ọrụ nchekwa ga-achọtariri ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ ka okwesiri. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Kabusa Oriental Choir: 'Egwu anyị na-atọwa mmadụ niile ntị' Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45532784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45532784,Zainab Ahmed: Anyị ga-agba mbọ ịkpatara Naijiria ego,Zainab Ahmed nọchiri Kemi Adeosun dịka Mịnịsta na-ahụ ego na akụnaụba Naịjirịa ebidola ọrụ na Monde ( 17/9/18).,"Ahmed bụbu mịnịsịta nta na-ahụ maka bọjetị nọchịrị Adeosun onye gbara arụkwaghịm maka ebubo gbasara asambodo adịgboroja na nsonso a. Onye odeakwụkwọ mịnịstri ahụ bụ Mahmoud Isa-Dutseha na ndị isi ndị ọzọ iji ọṅụ nabatara ya n'ịsị ụlọrụ ha n'Abụja. End of Twitter post, 1 Ọ gwara ha ka ha gbaa mbọ ịkwalite etu Naijiria si akpata ego iji mezuo ntukwasaobi onyeisiala nwere n'ime ha ha. ""Anyị nwere nnukwu nsogbu na ịkpata ego"". ""Ọ bụ ọrụ dịrị anyị ịgba mbọ hụ na ego Naijiria na-akpata gbalitere"". ""Onyeisiala nwere ntụkwasị obi na anyị jikọọ ọnụ, anyị ga-emeli ya"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51602837,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51602837,Anambra state: Ndị uweojii Anambara anwụchiela nwoke a na-ebo ebubo idina ụmụaka isii,Aka ndị uweojii akparala otu nwoke na-edina ụmụaka ụmụnwoke isii na-erughi eru n'ike n'Anambara steeti.,"Foto a abụghị nke nwoke ahụ e boro ebubo a Nwoke ahụ sị na aha ya bụ Bassey, kwuru sị na ọ chọrọ ọgwụgwọ nsọ n'ihi na ọ na-eche na ọ bụ mmụọ ọjọo na-enye ya nsogbu. A kpụpụla onyeisi ụlọomeiwu nta ụlọikpe Otu na-ahụ maka ikike dịrị onye bụ Socio-Economic Rights and Accountability Project nke a ma dịka (SERAP) n'ịchafụ na ndị Naịjirịa ruru otu narị na iri itoolu na abụọ ejikọọla aka ọnụ gbaa Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ụlọomeiwu nta akwụkwọ n'ụlọikpe. Iwe ha bụ ka ụlọikpe kwụsị atụmatụ ndị omeiwu iji ijeri naịra ise na ọma zụọ ụgbọala ọhụrụ ruru narị anọ ha chọrọ inye ndị ụlọomeiwu. Ọrịa Coronavirus Covid-19 Obodo Daegu na mba Saụt Koriya ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na mba ahụ kacha arị N'ofesi, Mba Saụt Koriya etisiela mkpu ike na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus covid-19 na mba ha ka na-arị dịka o gburula mmadụ ise ebe ihe karịrị mmadụ isii bu ya ugbua. N'egwuregwu, Real Madrid ekwuola na Eden Hazard bụ onye egwu ha gbajiri ụkwụ aka nri ya nke bụ na ọ gaghị eso agba bọọlụ mgbe ha ga-ezute Manchester City n'asọmpi Champions League n'ụbọchị wenesde. Ọzọ bụ na ndị Manchester United ji ọkpụ goolu atọ chara acha gwọọ Watford ịba n'Old Trafford. Bruno Fernandes na Anthony Martial nyere goolu tupu Greenwood enye nke atọ Odion Ighalo nke Naịjirịa e tinyere n'a nkeji iri asatọ nke ọkara nke abụọ ji ohere ahụ zute Watford bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ mbụ. 'Ọ bụ amaghị ihe ma onye ọchịchị jiri ụgbọala 20 na-aga n'ụzọ' Onye ji ọkọlọtọ People's Democratic Party(PDP) zọọ oche osote onyeisiala na ntụliaka 2019 ekwuola hoha na ọ bụ amaghị ihe ma onye n'ọchịchị iji ụgbọala iri abụọ na-aga n'ụzọ. Peter Obi na-ekwu nke a n'emume maka ndị gụchara mahadum Veritas. Obi kwuru na n'oge ọ bụ Gọvanọ Anambra steeti na ụgbọala iri abụọ na-eso ya. Kama otu ụbọchị, ọ chọpụtara na n'ime ụgbọala ndịa, na iri na atọ n'ime ha ebughi mmadụ ọbụla. O kwuru sị na "" ụgbọala iri abụọ ndịa bụ ọgbataughie nye ndị mmadụ, ma na-eme ka njem siere ndị mmadụ ike"". Obi si na ọ bụ nanị na Naijirịa ka ndị mmadụ na-akpa ụdịrị agwa a. Ọ rịọrịọ ndị ntororbia ka ha nyere aka ma tinye uchu n'idozi ọchịchị na Naijirịa. O kwuru sị "" Anyị nọ n'ajọ ọnọdụ, mu onwe m nọ n'ajọ ọnọdụ. Onye gwara gị na anyị na-eme ọfụma na-asị asị. "" Obi sị kwa na ụjọ na-atụ ya ụbọchị ọbụla maka na ezigbo nchekwa adịghị. Maka nzukọ Aisha Buhari na nwunye ndị isiala chịburu na mbụ Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na onweghị ihe gbasara ndọrọndọro ọchịchị na nzụko nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị na nwunye ndị isiala chibụrụ mbụ. Ọ bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ụlọọrụ nwunye onyeisiala bụ Aliyu Abdullahi kwuru nkea were sị na nzụkọ ha bụ maka ịkwado ụmụnwaanyị Naịjirịa. N'ofesi Onyeisiala mba Itali bụ Giuseppe Conte sị na-agaghị ekwe ka mmadụ bata ma ọ bụ pụọ obodo 12 ahụ Mba Italị amachiela obodo iri na abụọ nke dị na Lombardy na Veneto maka ọrịa Coronavirus. Nke a na-abịa dịka mmadụ abụọ nwụrụla na ya bụ ọrịa ebe mmadụ iri asaa na itoolu bụ ya na mba Itali. N'Egwuregwu N'agba nke asaa ka onye nchịkọta kwụsịrị asọmpị a Na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ. Nke a bụ eziokwu dịka Tyson Fury tipuru Deontay Wilder ndi mụo n'anya na asọmpi WBC. Ọ bụ na agba nke asaa ka ndị ndu Deontay Wilder weliri aka elu tupu asọmpị ha biara abụru ihe ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị" 43237845,https://www.bbc.com/igbo/43237845,Tottenham na-ele anya iburu iko FA na mmeri Rochadale,"N'egwuregwu, ndị otu Tottenham gbara ndị Rochadale ọkpụ goolu isii asatara otu n'asọmpi FA.","Tottenham emerila n'asọmpị iko FA ugboro asatọ Mmeri a pụtara na Tottenham na otu Swansea ga-asọ mpi Quarter Final n'iko FA a ga-agba n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị. Son Heung-min nyere goolu nke mbụ na nke ise. Fernando Llorente nyere goolu atọ n'ime nkeji iri na abụọ n'okara nke abụọ, ebe Kyle Walter-Peters nyere goolu nke isi. Son Heung-min kwụsị bọọlụ otu Rochadale Gịnị ga-eme n'ihu? Tottenham ga-aga ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị. Ha na Huddersfield ga-asọ mpi n'iko Premier League, tupu ha na Juventus ga-asọmpị nke ha n'iko Champions League n'ụbọchị asaa n'ọnwa Maachị. Otu egwuregwu Rochdale nwere asọmpị 16 ịzọpụta onwe ha tụpụ ha baa relegation na league otu. Asompị ha nke mbụ ga-abụ ha na Plymouth n'ụbọchị atọ n'ọnwa Maachị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48836958,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48836958,COZA: Nathaniel Bassey o kotela ebu maka okwu ụlọụka a?,Onye otiegwu amaama bụ Nathaniel Bassey etinyele ọnụ n'ihe gbasara okwu nwakpo dị na etiti Busola Dakolo na onyendu COZA bụ Biodun Fatoyinbo.,"Ọ mere ihe onyonyo a na-akpọ ""instagram Live"", ma were ohere ahụ were kwuo obi ya na okwu nwakpo ahụ. Ihe mere ede ji bee nwịị maka COZA Agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Obowo Imo Steeti Dị ka ọ mechara nkea, ụfọdụ ndị mmadụ na-eto ya ma ebe ụfodụ na-akatọ ihe o kwuru. Lee nchikota ihe okwuru. End of Instagram post, 1 Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka okwu Nathanjiel Bassey n'igwe twitter. Ekweteghi m n'aro nke anọ, ndị okenye n'elekọta ụka ekwesighị ikpe ikpe gbasara mpụ maka nkea bụ ọrụ ndị gọọmenti kama ha nwere ike ikpe ikpe gbasatara omụme. Ihea abụghị olileanya m ebe Nathaniel Bassey nọ. Enweghị ihe di njọ na nchịkọta ihe Nathaniel Bassey kwuru . . . e kwenyere'm, kwesie ike. Nathaniel Bassey gbuwara ya nke ọma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44877309,https://www.bbc.com/igbo/44877309,"Idemmiri Katsina: Nwaanyị lụrụ di na Fraide, lọkwute ya na Satode, mmiri eburu ya ụbọchịụka",Akụkọ arịrị na obi mwute na-eso ọdachi oke idemmiri mere na Katsina steeti dịka ndị ihe metụtara ka na-agụkọ ihe ọ pụrụ ha.,"Oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri anọ na Katsina Ọtụtụ ndị mmadụ tufuru di ha, nwunye ha, ụmụ ha nakwa ihe ndị ọzọ ha nwere. Otu nwaanyị gbakwara akwụkwọ ụbọchị Fraiday ma soro dị ya lọta na Satọde mana idemmiri napụrụ di ya nwunye ọhụrụ ya. Ndị gara agbamakwụkwọ ha gwara BBC na akụkọ nwaanyị ahụ wutekarịrị ha n'akụkọ mkpamkpa kpara n'obodo ahụ. Na nso nso, oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri ise(50) na Jibiya dị Katsina steeti. Otu nwoke nwa ya nwaanyị dị ọnwa atọ tụrụ arịrị na ọ bụghị naanị na mmiri buru nwa ya, na otu foto ọ kara iiji echeta ya dị n'ime ekwenti o jiri seta ya so n'ihe ndị idemmiri buru. ""Ugbu a onweghị ihe m ga-eji na-echeta nwa m n'ihi na mmiri eburula ekwenti m."" O nwekwara nwaanyị ajadu ya na ụmụ ya atọ tọrọ n'ụlọ ha. Ndị agbata obi gbalịrị inye aka zọpụta ha mana ide buru ha bufuo. Ka ọ dị ugbua, gọọmentị na ndị otu na abụghị gọọmenti agbatarala ndị ihe mere ọsọ enyemaka mana ndị obodo na ekwu na enyemaka ha ezughị ọnụ." afirika-44120768,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44120768,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Palestine na-akwado ime ngagharị iwe,Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Na Naịjirịa,"Bishop Alex Ibezim bụ Bishọp ndị Angịlịkan na Ọka Dayasis Bishọp Alex Ibezim ụka Aglican nke Awka Diocese ekwuola na ike agwula ndị Naịjiria ị nara ozi ị ti aka n'obi. Ọ gwara onyeisiala Buhari ka ọ ghara ị hụ ndị na-achị ehi na-egbu mmadụ dịka ndị ụmụnna ya. N'okwu yiri ibe ya... Otu ọzọ na-achọ mwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra Onye ndu otu Biafra Independence Movement bụ Ralph Uwazuruike ekwuola na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa bụ nkata ọchịchị Buhari iji gbanwee Naịjiria ka ọ bụrụ mba ndị Alakoba. O kwuru na otu ihe a mere na Kwara Steeti n'afọ 1811 mgbe egburu onye ndu ndị Yoruba ma were ọchịchị rue ugbu a. Akụkọ ofesi Ndị mba Palestine na-akwado ime ngagharị iwe megide mba Isreal maka ogbubu ndị mmadụ dị iri ise na ise ndị agha mba Isreal gburu echi gara aga Egwu ga-adị na Gaza bụ ebe agaelị ndị nwụrụ anwụ. N'Egwuregwu, Mba Austrelia agwala ndị zoro n'obodo ha n'oge egwuregwu Commonwealth ka gosi onwe ha ugbua ma ọ bụ a nwụchie ma tụlata ha n'ike. Ebe... NFF bụ Amaju Pinnick ekwuola na otu Super Eagles na ndị DR Congo ga-aga n'ihu ezute n'asọmpi enyi na enyi agbanyeghi akụkọ ọrịa ebola. Ịhe ọzọ ị kwesiri ị ma Awaala Melania Trump, nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ahụ maka akpụ dị n'akụrụ ya. Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Ihe Uche Ogbuagu huru mgbe ọrụọrụ na gọọmenti Imo Steeti" afirika-53301489,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53301489,"Ebonyi State Crisis: Etu e si wakpo, gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti",Kenneth Okoro Agha bụ onyeisi ndị ntoroọbịa n'obodo Okoli Agha dị n'okpuru ọchịchị Afikpo South kọwaara BBC Igbo etu ndị ekperima si gbuo mmadu abụọ ndi obodo ha ma tọrọ mmadụ ise.,"Maazị Agha sị na nsogbu a malitere na afọ abụọ gara aga oge esemokwu dapụtara n'etiti ha na ndị agbataobi ha bụ Egbọm dị n'okpuru ọchịchị Biase di na steeti Kross Riva. O kwuru sị: ""Ọ bụ gọọmentị Owụwa Anyanwụ kụrụ nkwụ n'ala na-esere anyị na ndị agbataobi anyị. ""Ọdọ nkwụ a banyere ala Kross Riva, Abia nakwa Ebonyi. ""Kemgbe anyị niile na egbukọta nkwu ebe ahụ mana n'ime afọ abụọ gara aga, ndị agbataobi anyị resiri otu nwoke Anambara ọdọ nkwụ ahụ."" Ọ sị na esemokwu pụtara kemgbe e rere ya bụ ọdọ nkwụ kpatara ogbugbu mmadụ abụọ n'ime afọ abụọ gara aga. ""Agbagburu otu onye na Julaị 12, gbagbuo onye nke ọzọ na Decemba 4."" Maazị Okoro-Agha si na ọ bụkwa ndị Egbọm a wakporo ndị be ha gara igbu akwụ na ọdọ nkwụ ahụ ma gbuo mmadụ abụọ. Ndị e gburu bụ Ndukwe Okoroafor, dị afọ 55, na nwunye ya bụ Paulina Ndukwe, dị afọ 49. Nwa Ndukwe Okoroafor bụ Kalu Ndukwe, onye hụru oge ihe a mere, bu mgbo egbe gbalaa. Ndị mwakpo a kpụụrụ Esther Ikwo, Elizabeth Ikwo, Chinecherem Nnachi, Ogbonna Aku na Sunday Ogbuu Ama gbalaga. Ha bukwa ozu mmadu abụọ ahu ha gburu. Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi gwara BBC na okwu ahụ ka kwụ otu ọdi oge ahụ o mere. Ọ sị: ""Anyị na-eme nchọpụta ma na-agba mbọ ịhụ na-enwetere ndi kpara arụ a."" Odah kwenyere na ọ bụ ọzịzọ ọdọ nkwụ butere esemokwu a ma kwuo na ọ dị mkpa itinye ndi uweojii ebe ahu ịhụ na ọzọ emeghị." afirika-51542332,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51542332,Ihedioha vs Uzodinma: E yigharịala ụbọchị nlebanya n'ikpe Ihedioha and Uzodinma,"Ụlọikpe kachasị agbatịala ụbọchị ha ga-elebanye n'ikpe ha kpere n'isi Emeka Ihedioha na Hope Uzodinma gawa 2 Maachị, 2020.","Ndị ọkaikpe mmadụ asaa nke ọkaikpe Tanko Mohammed nọ n'isi tụlere mkpesa Ihedioha ma yigharịa ụbọchị ha ga-etinye ọnụ ya. Ọnụ na-ekwuru Emeka Ihedioha bụ Adaora Onyechere gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke a bụ eziokwu. Emeka Ihedioha bụ onye a na-apụrụ ọkwa na ndị ọkaiwu ya mere mkpesa ka ụlọikpe nyochaa ikpe ahụ nkeọma. Nke a mere ụlọikpe ji nọrọ n'ụbọchị Tọzde iri na atọ nke ọnwa Febụwarị nabata ilebanya n'ikpe a ha kpere. Ụfọdụ otu na-akwado Hope Uzodimma bụ gọvanọ Imo steeti ugbua emeela ngagharị igosi nkwado ha n'ọchịchị ya. Ha bụcha ọkọlọtọ ndị APC wee mee ya bụ ngagharị. Cheta na ndị uweojii Imo steeti machiri ime ngagharịwe na steeti ahụ ụnyahụ. Ọ bụ n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị ka ha chabiri ikpe ahụ chụpụrụ Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma. Kamgbe ahụ, ndị pati PDP na ndị ọtụtụ ndị Imo steeti na-eme ngagharịiwe n'Imo, Abuja nakwa ebe ndị ọzọ sị ka e kpegharịa ikpe ahụ. Mana ndị uweojii Imo Steeti nọọrọ ụnyaahụ machie ime ngagharịiwe na Steeti ahụ. Ha sị na ụfọdụ ndị omekome chọrọ iji ohere ahụ mee mpụ dị iche iche n'Imo Steeti. Slow Dog asaala ndị DJ Enugwu Otiegwu a ma dịka Slow Dog asaala mmachi otu ndị na-akpọ egwu a kpọrọ DJ machiri ya n'Enugwu steeti. Slow Dogg gwara BBC Igbo na ọ bụghị ya na ndị DJ niile nwere okwu, kama na ọ bụ akpọ nke onyeisi ha bụ DJ Grandfingaz na-ebusa ya wetere nsogbu mmachi a. Mara na ndị DJ Enugu steeti gbakọtara kwuputa na ha agaghị akpọzị egwu ya n'ọha nakwa na redio. Innoson na ndị omeiwu Naịjirịa: Innocent Chukwuma Innocent Chukwuma asaala ndị Naịjirịa sị na ha anaghị amanye ndị mmadụ ịzụ ụgbọala ha n'agbanyeghi na ha na-arụrụ ya ndị be anyị. Nke a na-abịa dịka ndị ụlọomeiwu jụrụ ụgbọala nke e mere na Naịjirịa, sị na ọ bụ nke e mere na mba ofesi masịrị ha. Gụọ maka okwu a n'uju ebe a: Anyị anaghị amanye ndị mmadụ ka ha zụọ ụgbọala anyị - Innocent Chukwuma N'ofesi, Ụlọikpe dị na mba Denmark ga-ekpebi ikpe otu nwaanyị a kpọrọ Britta Nielsen bụ onye a na-ebo ebubo maka izu ego gọọmentị ruru nde dọla iri na asaa n'ime ihe ruru afọ iri abụọ na ise. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, tupu e jide ya n'afọ 2018 ka ọ na-ezukpu ego n'ọbaego nke ya. Nsogbu Tottenham nwere Son Heung-Min adịghị achi ma ncha Jose Mourinho na-achịkọta Tottenham na-atụ ụjọ na Son Heung-Min agaghị esozi ha gbazuo bọọlụ n'afọ a. A ga-awa Son gbajiri aka n'ụbọchị ụka ahụ, ma chere mgbe ọ ga-agbake. Kenya nwuchiri ndị ji akpa wakịrị ere ihe n'okporoụzọ Ọtụtụ ndị mba Kenya ewela iwe maka nwuchi gọomenti ha nwụchiri ndị ji akpa wakịrị wakịrị ere ihe n'okporoụzọ. Mmadụ atọ ka a kpọpụrụ n'ụlọikpe taa n'iwu sị na ha ga-akwụ nde shịlịn anọ maọbụ gaa mkpọrọ. Ndị nkuzi Mahadum Gana na-emetọ ụmụakwụkwọ Mahadum Gana akwụsịtụla ndị nkuzi abụọ ọrụ maka ihe onyonyo BBC Africa Eye gosiri ka ha na-emetọ ụmụakwụkwọ. A gaghị akwụ ha ụgwọ ruo oge niile ha ga-anọ n'ọnọdụ a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ụlọikpe amachiela Inec iwepụ aha pati Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaikpe Anwuli Chikere nọ n'isi ya amachiela ụlọọrụ Inec iwepu aha pati ọbụla site n'isonye na ntuliaka. Ụlọọrụ Inec nọrọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Febụwarị wepu aha pati iri asaa na anọ ka ha ghara isonye na ntuliaka. N'ofesi Ụlọọrụ na-arụ ekwenti Iphone bụ Apple ekwuola na ọrịa coronavirus na-arị elu na mba Chaịna emetụtala ego mbute ha. Ha kwukwara na ọnọdụ a ga-akpachịtụ etu ha si ekesasị ekwentị Iphone na mbaụwa. N'egwuregwu Ịnụla etu Manchester United sị rie Chelsea ka ọkpa dị site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu n'asọmpi Premier League. Chelsea nyere goolu abụọ n'asọmpi a mana ihe onyonyo na-enyere ogbu opii aka a kpọrọ Video Assistant Referee gụpụrụ ha. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'" egwuregwu-49954269,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49954269,Man City vs Wolves: Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ,"'Ma nwata erughi eru wara ọgọdọ, ọgọdọ awụchie ya anya' bụ ihe Wolves mere Manchester City","Wolves ji ọkpụ goolu abụọ chara acha tie Man City mmọnwụ n'ụlọ ha bụ 'Etihad Stadium'. Otu egwu bọọlụ abụọ ndị a siri ọnwụ na onweghi onye ga-enye ibe ha goolu ruo ngwụcha ọkara mbụ n'asọmpi a. Mana n'ime ọkara nke abụọ dịka ọ fọrọ nkeji iri ka e gbuchie bọọlụ, Wolves nyụrụ nsị n'ụlọ Man City site n'inye ha goolu. Goolu mbụ a Wolves nyere si n'aka Adama Traore na nkeji 80. Dịka Man City ka na-esi ọnwụ ịsa otu goolu a, Adama Traore wụchasịrị ha goolu ọzọ n'isi n'ime nkeji 90. Ọdịda a Manchester City dara ji ọnụọgụgụ asatọ dọlaa ha azụ n'ịchukwute Liverpool bụ ndị mbụ na tebụlụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50446449,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50446449,Igbo funeral rites: Usoro e ji eli nwaanyị n'ala Igbo,Ndị Igbo na-ahụta ọnwụ mmadụ dịka mmebi nke anụahụ na ọ bụghị mmebi nke mmụọ dịka ha kwenyere na mmụọ onye ahụ ga na-anọ n'etiti ha n'oge niile.,"Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada Ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ihe dịrị ndị ezinaụlọ ya bụ ili ya nke ọma iji kwanyere onye ahụ ugwu nke ikpeazụ. Nwaanyị nwụọ n'ala Igbo e nwere usoro omenala ndị a ga-agbaso iji hụ na e liri nwaanyị ahụ nke ọma ebe mkpụrụobi ya ga-ezu ike. Ụdịrị ọnwụ ọ nwụrụ ga-abụ ihe ga-egosi etu a ga-esi lie ya. Ọ bụrụ na ọ nwụrụ 'ajọnwụ' dịka etozughi oke, amụghị ụmụ, ọ nwụrụ n'ụbịam, n'ihe mberede maọbụ na aka mmadụ dị n'ọnwụ ya, dgz, a gaghị e me oke emume n'ili onye ahụ. Mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụrụ 'ọnwụchi' dịka itozuoke nwaanyị, nwee ụmụaka, kaa nka, olili ya ga-ejupụta n'oriri, ọṅụṅụ nakwa nkwari. Akụkọ a ga-eleba anya n'usoro e ji eli nwaanyị tozuruoke ( lụrụ di, mụọ ụmụ, kaa nka) tupu oge ọnwụ ya. A bịa n'ala Igbo a na-ahụ nwaanyị lụrụ di dịka onye nwere ezinaụlọ maọbụ obodo abụọ; obodo ebe a mụrụ ya na obodo ebe a lụrụ ya. BBC Igbo tulere usoro dị iche iche e ji eli nwaanyị n'ụfọdụ steeti ndị mejupụtara ala Igbo nke gụnyere Abia, Anambra, Imo, Enugwu na Ebonyi. Abia Steeti Otu onye ọdịnala bụ Maazị Kalu Okorie Uzu kọwara na ọ bụrụ na nwaanyị nwụọ, na ihe mbụ ezinaụlọ ebe a lụrụ ya (ụmụ ya na di ya) ga-eme bụ ị ga gwa ezinaụlọ ebe a mụrụ ya na nwa ha nwaanyị anwụọla. Ha ga-eji mmanya, ọji na ihe ndị ọzọ gaa mee ka ndị ọgọ ha mara. Dịka ha mechara nke a, ezinaụlọ ebe a lụrụ ya ga-anọkọ kpaa maka mgbe a ga-eli ya. Ọ bụrụ na ha kpebie oge a ga-eli nwaanyị ahụ, ha ga-alaghachị n'ezinaụlọ a mụrụ ya ma mee ka ha mata maka ụbọchị ahụ. Ezinaụlọ ebe a mụrụ nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe niile ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nye ha , nke gụnyere mmanya, ọjị, nri, ụfọdụ na-asi ka e gbuoro ha ewu, atụrụ, ehi nakwa ihe ndị ọzọ. N'ọge olili ya, ezinaụlọ ebe a mụrụ ya ga-eji onyinye dị iche iche ha ji 'akwa ozu' nwa ha nwaanyị gaa n'ebe ndị ọgọ ha maka olili nwaanyị ahụ. Anambra Nwaanyị nwụọ, ndị ezinaụlọ a lụrụ (ụmụ ya na di ya) ga-eji mmanya, ọji gaa mee ka ndị mụrụ ya mara. Ihe mbụ ndị mụrụ ya na-eme dịka ha nụrụ ozi ọnwụ ya bụ na onyeisi ezinaụlọ ga-egbu ọkụkọ ma tụọ aja tupu ha gawa ịhụ ozu nwa ha nwaanyị. Dịka ha hụchara ozu nwaanyị ahụ, ha ga-agwa ndị lụrụ ihe ole na ole a chọrọ n'aka ha, gụnyere ewu, ọkụkọ, akwa, nzụ, nakwa mmanụ otite. Ọ bụrụ na oge ili nwaanyị ahụ ruo ezinaụlọ mụrụ ya ga-atụkwa aja n'isi tupu ndị lụrụ elie ya dịka omenala ha si dị. Ebonyi Steeti Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada Odoziakụ Mercy Egwu sị na nwaanyị nwụọ, na ụmụ ya ga-eji mmanya na ọjị ga mee ka ndị ikwu ya mara na nwa ha nwaanyị anwụọla. Ndị ikwunne ha ahụ ga-abịara ụmụ nwaanyị ahụ mgbaru ma soro ha rie uju maka ọnwụ nne ya bụ nwa ha nwaanyị. Ezinaụlọ abụọ ndị a ga-abịa dorita isi iji ịmata ụbọchị ụmụ nwaanyị ahụ ga-achọ ili ya. N'ụbọchị olili nwaanyị ahụ, ụmụ ya nwereike iji ehi, ewu maọbụ ọkụkọ nye ndị ikwunne ha ebe ndị ikwunne ha ga-enyekwa ha onyinye dịka nri, ọjị, mmanya n'ịbịara ha olili nne ha. A gaghị edosa ozu nwaanyị ahụ n'ihu ama (ogo), a gaghị esi n'ihu ezi kama a ga-esi n'azụ ụlọ buba ya n'ime ụlọ. Enugwu Steeti Nwaada Blessing Ada Ifeanyi sị na ọ bụrụ na Nwaanyị ọkachasị onye bụ Ada nwụọ na ụmụaka ya ga-eji mmanya, ọjị na ihe ndị ọzọ gaa ebe a mụrụ nwaanyị iji mee ka ha mara na ọ nwụọla. Dịka ha mere nke a, ndị ikwu nne ga-ekunye ha mmiri ọṅụṅụ iji gosi nnabata ozi ahụ nakwa inye ụmụaka ya ikike iri nri n'ụlọ ebe a mụrụ nne ha. A bịa n'ihiwe ụbọchị a ga-eli nwaanyị, ọ bụ ezinaụlọ mụrụ nakwa ezinaụlọ ebe a lụrụ ga-anọkọ iji hiwe mgbe ga-amasị ha ili nwaanyị a. Ọ sị na ọ bụrụ na e soghi usoro ndị a, na mmụọ nwaanyị ahụ ga-aga n'akpa ike dị egwu n'ezinaụlọ ebe a mụrụ ya. N'oge olili ya, ndị mụrụ ga-azụta akwa, ọjị, mmanya dgz gaa ịkwa ozu nwa ha nwaanyị n'ebe a lụrụ ya nke a kpọrọ 'ụlọakwa'. Ezinaụlọ ebe a lụrụ nwaanyị ahụ ga-anabata onyinye ndị si n'aka ndị ọgọ ha ma nyeghachị ha, tinyekwara ihe ọzọ a ga-achọ n'aka ha. Imo Steeti Dịka oriakụ Margaret Okere sị kọwaa, ọ bụrụ na nwaanyị tozuruoke nọrọ n'ụte ọrịa, ụmụ ya ga-aga mee ka ndị mụrụ ya mara na ahụ esighi ya ike. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụọ, ụmụ ya ga-alaghachị ga gwa ha na ọrịa ahụ na-arịasi nne ha ike. Ezinaụlọ mụrụ nwaanyị ahụ ga-abịa hụ ozu ya tupu etinye ya n'ime njụ oyi. Ọ bụrụ na oge e ji eli ya ruo, ụmụ ya ga-aga kwa gwa ndị ikwunne ha na ha chọrọ ili nwaanyị ahụ. Ndị ikwu nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe ndị ha chọrọ ka ụmụ ya mere ha nke gụnyere anụ ehi a manyere akwa 'George', ọjị, mmanya dgz. (Ịkwa ngwa ozu). N'oge olili nwaanyị ahụ, anụ ọbụla ụmụ ya gburu e ji eli ya, ha ga-enye ndị ikwunne ha akụkụ anụ ahụ ruru ala. Ihe gbapụtara ihe n'usoro niile a Usoro ndị Igbo ji eli nwaanyị bụ na" egwuregwu-49703093,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49703093,Wolves vs Chelsea: Chelsea emechiela nkịta ọhịa na-alụ Man Utd ọnụ n'ike,Ụbọchị taa abụghị ụbochị ọma nye ndị Wolves dịka ndị Chelsea jiri goolu saa ha ahụ.,"Ụmụ Naijiria abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori gbachara aka ahịa ka goolu nọ na-arị ibe ya elu n'egwuregwu a. Tomori tikpuru goolu na nkeji 31 ebe Abraham nyere goolu atọ ya na nkeji 34, 41 na 55 tupu ọ gbakpuo nke o ji gbaara ndị Wolves aka ahịa na nkeji 69. Patrick Cutrone tụkwasịrị ọzọ iji nye ndị Wolves olileanya na nkeji 84, tupu Mason Mount abịa kụchie akpati ndị Wolves na nkeji 90 na ụma e ji egbuchi bọọlụ. Ndị Chelsea gosiri ndị Wolves na ha enweghị nsọpụrụ, dịka ha ji goolu niile a (goolu ise a satara naanị abụọ) gaa leta Wolves n'ụbọchị ncheta afọ 130 e ji rụọ ọgbọegwuregwu ha bụ Molineux. N'agbanyeghị na ndị Chelsea emeriela naanị otu asọmpi n'ime anọ ha gbarala, ha eleghị anya n'azụ were jiri goolu zuo ndị Wolves ahụ. Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ na ""ọ bụ ụmụaka abụọ a bụ Tammy Abraham na Mason Mount nọchiri anya Didier Drogba na Frank Lampard?"" Nke a bụ maka na ụmụokorobia a na-arụkọ ka ndị zoro ezo na-ere ala nna ha. Tammy Abraham zara aha ya dịka ""nna ụwa niile"", ka o nyekọrọ goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke Bekee kpọrọ ""Hattrick"". Kama o tikpukwara otu goolu na neetị ndị nke ya, mana ọ dị ka ndị nkwado Chelsea ga-agbaghara ya maka nke a. Abraham abụrụla onye kacha bụrụ nwata nyere goolu atọ n'otu asọmpi na Premiership. Chelsea gosiri na nkata ha na-ehi ehi n'agbanyeghị na ha nyere goolu ise, ebe ndị Wolves gakwara n'ihu jisiike sata goolu abụọ. N'aka nke ọzọ, ka ndị otu egwu bọọlụ Manchester United gbara nke ha, ha jiri otu ọkpụ goolu were merie ndị nke Leicester City bụ ebe. Mana ka ọ dị ugbua, anyi amarala mbe na-abọ nke bụ oke. Akụkọ ga-amasi gị" 49950408,https://www.bbc.com/igbo/49950408,Teachers' Day: Etu Anambra si kpokọrọ nturugo nke onyeisiala,Ndị nkuzi nọ n'Anambra steeti ritere nturuugo anọ n'aka onyeisiala Muhammadu Buhari dịka e mere ncheta ndị nkuzi n'ụbọchị ise nke ọnwa Oktoba.,"Nturuugo a bụ nke a na-enye ndị nkuzi na ụlọakwụkwọ bụ ọkaibe na Naịjirịa dịka ụlọọrụ mgbasaozi ""Anambra Broadcasting Commision""(ABS) si depụta. Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis Nturuugo ha ritere gụnyere Onyeisiala Buhari site n'ọnye nnọchite anya ya na mmemme ya bụ okaipe ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami SAN, kwuru na obi dị ya ụtọ maka isiokwu ncheta ndị nkuzi nke afọ a makana ọ gbadoro ụkwu na etu ndị nkuzi ga-esi na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ndị ga-enyere nwulite obodo aka akwụsị akwụsị. O kwukwara na a ga-enwetali agụmaawụkwọ zuruoke na Naịjirịa site na nnabata, nghọta, nakwa ịnwe nghọtata maka ndịche ụmụakwụkwọ ụfọdụ nwere. Kọmishọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Anambra steeti bụ ọkammụta Kate Omenugha kwuru na mmeri a gosiri na nkwado gọọmenti Anambra na-enye agụmaakwụkwọ na steeti ahụ abụghị na nkiti. Cheta na isiokwu nke ụbọchị ncheta ndị nkuzi nke afọ a bụ 'Ndị nkuzi ntoroọbịa: Ọdinihu ọrụ nkuzi. N'afọ 2017, Clement Nwoye Okodo bụkwa onye Anambra steeti ritere nturuugo onye nkuzi kachasị na Naịjịrịa nke onyeisiala hibere. Akụkọ ndị ga-amasị gị 'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ'" afirika-49268715,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49268715,Food Security: Ihe anọ nwereike ibute oke ụkọ nri na Naịjiria,Otu ihe mmadụ ọbụla agaghị achọ ịgabiga n'ụwa a bụ oke agụụ sitere n'ụkọ nri.,"Ya ka Igbo ji ekwu na agụụ bụ otigbu nwata n'ihu nne ya. Na mba Zimbabwe, oke agụụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ ugbua n'ihi ụkọ mmiri ozuzo nakwa ụkọ ego dịka otu United Nations si maa n'ọkwa. Nke a kpatara BBC Igbo ji jụọ ndị ọkachamara ihe obodo Naijiria ga-eme iji gbochie oke agụụ n'ọdịnihu. Ha rụtụrụ aka ihe ole na ole nwereike ibute ụkọ nri na oke agụụ ma kwuo ka gọọmentị were ehihie chọwa ewu ojii tupu chi ejie. 1. Enweghị ezi nchekwa Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ezutela ndị Fulani na-achị ehi bu egbe ukwu agagharị Dịka ihe gbasara mwakpo ndị Boko Haram nakwa ndị ọchịehi bụzị okwu a kpụ n'ọnụ na Naijiria taa, ọtụtụ ndị mmadụ anaghị agakwa ịkọ ugbo n'ihi ize ndụ. Ọtụtụ bụ ndị ehi bara n'ubi ha mebichaa ihe ha kọrọ, ebe ndị ọzọ ka ndị ọchịehi wakporo n'ubi ha ma tọrọ ha. Marlene Udumka bụ onye na-eme nnyocha banyere ịkọpụta nri bụ nke Bekee kpọrọ ""Crop Science"" kwuru na ihe dị otu a mere gawa, egwu dị maka mmepụta ihe oriri na Naijiria. 2. Oke ire ala maka ịrụ ụlọ Ọtụtụ ala e jibu akọ nri bụzị nke ndị mmadụ zụrụla were ha na-arụ ""estate"" Udumka kwukwara na ọ dịghị mma otu e si ere ala e kwesịrị iji kọpụta nri, maka ịrụ ụlọ. O kwuru sị, ""ebe ọbụla ị gara ugbua, ihe na-ewu bụ ịrụ ụlọ. ""Ndị ọgaranya na-aga gbara ala buru ibu, were ya rụọ ""Estate"", e nweghikwa ubi maka ịkọ nri. ""O kwesịrị ka e nwee mpaghara ala a ga-ewepụta naanị maka iji kọpụta nri, ghara iji ebe niile arụ ụlọ."" 3. Oke mmiri ozuzo Oke mmiri ozuzo adịghị mma maka mmepụta nri Ọ bụ eziokwu na mmiri ozuzu dị mma maka ihe a kụrụ n'ubi, mana oke mmiri adịghị mma. Dịka Udumka siri kwuo, oke mmiri ozuzo nwere ike ịsachapụ ihe na-enye aka ka ihe a kụrụ n'ubi na-eto ọfụma. Bekee kpọrọ nke a ""Leeching"". Ọ bụrụ na nke a mee ogologo oge, ala ahụ agaghị na-amịtakwa ihe etu o si eme na mbụ. Mana ndị ọkacha mara kwuru na e nwere ike igbochi nke a site n'ime nke a kpọrọ ""mulching"". ""Mulching"" pụtara iji ahịhịa pụrụ iche maọbụ ịkụ ihe akụkụ nwere ike gbochie mmiri ịsachapụ aja ala. 4. Ume ngwu Agriculture in Nigeria: 'Eji m ọrụ ugbo achụ ụbịam na agụụ ọsọ ụkwụ erughi ala' Ọkammụta Popoola Yemi, na mkparịtaụka ya na BBC, kwuru na ọtụtụ ndị ntorobịa ugbua dị umengwụ. Nke a mere na ha na-anọ otu ebe na-eti na gọọmentị enyeghi ha ọrụ. O kwuru sị: ""Ọ bụrụ na ndị ntorobịa tinye anya n'ihe gbasara ịkọpụta nri nakwa ịzụ ụmụanụmanụ, onweghi onye ga-anụ na ọrụ adịghị. ""Ọtụtụ amaghị na nnukwu ego dị n'ịrụ ọrụ ubi."" Yemi gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị kwesịrị inyere ndị ntorobịa aka, nye ha ọzụzụ nakwa obere ego ha ga-eji malite ihe dịka ịzụ azụ, ịzụ nchị, ịzụ ezi, ịzụ ejula, na ndị ọzọ. Ọ dịzị gọọmentị Naijiria na ndị ọha obodo n'aka ibido ugbua gbawa ọsọ mmiri tupu o bido zowe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe nkiri ga-amasị gị: Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium" egwuregwu-47575706,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47575706,FA Cup: Man City egwukpọọla Swansea anya,"Aha Man City gaara abụ ""ndo"" taa dịka Swansea malitere ikpa ike n'oge, mana egwu mechara dagharịa n'ọkara abụọ oge ha zụtara ihe a tụrụ ha n'ahịa.","Ihe mgbu Man City malitere ka Swansea wụrụ ha goolu abụọ n'ime naanị nkeji 30 e ji bido ịgba bọọlụ. Matt Grimes ji penariti gbakpuo goolu mbụ ndị Swansea n'ime nkeji 20, ebe Bersant Celina gbabuuru Man City bọọlụ ji ibu kara aka gbakaa neetị ndị bụbu ọga ya, iji mee ka Swansea nweta goolu ha nke abụọ na nkeji 29. Ọkara abụọ mgbe egwu dagharịrị Mbata Sergio Aguero na Raheem Sterling mere ka ndị Man City dị ka ndị a kpọlitere n'ụra ọnwụ, nke mere ka ha chakesia chọwa ihu poostu ka a na-anwụ anwụ. Man City mechara gbaa aka ahịa ka Bernardo Silva gbakpuru bọọlụ na neetị na nkeji 69. Kristoffer Nordfeldt bụ ochegoolu Swansea tibara bọọlụ na poostu ya ka Aguero gbara penariti biri na poostu, nke pụtara goolu abụọ Man City nwetara. Ọdịda Sterling dara iji nweta ya bụ penariti, bụ ihe a nọ na-enyo enyo maka na o yiri aka enwe bara n'ofe. Na nkeji 88, Aguero bụ ""dibia afa"" ndị Man City gbakpuru goolu mere ka e were ntu kụchie igbe olileanya ọbụla ndị Swansea nwere igafe agba nke isii a; e nyokwara goolu nke a enyo makana ọ dịka wuruwuru ọ banyere na ya. Etu ọ dị ugbua, Man City ka na-atụ anya ibuli iko ụzọ anọ (Champions League, Premier League na FA Cup); cheta na ha ebuliela iko Carabao nke afọ a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50937958,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50937958,Uche Nwosu: 'Ọ gara nlegharị anya na AA ma laghachite APC '- FCC Jones,Ọnụ na-ekwuchitere pati APC n'Imo steeti bụ FCC Jones ekwuola na Uche Nwosu alaghachitela otu All Progressives Congress bụbu pati ya.,"Cheta na Nwosu zọburu ọkwa gọvanọ n'okpuru otu Action Alliance na ntuliaka 2019. Jones kwuru na Uche Nwosu gara nlegharị anya n'otu AA mgbe ọ zọrọ ọchịchị n'okpuru pati ahụ maka oke nrụrụaka juru pati APC mgbe gara aga. N'okwu ya, 'ihe a dị n'atụmaatụ a na-ahazi kamgbe."" ""Ugbua Uche Nwosu ga-esonye Rochas Okorocha nakwa Muhammadu Buhari bụ onyeisiala."" O kwuru na Uche Nwosu kwenyere na APC kamgbe ụwa ma ga-esokwa dozie ya bụ pati ka ihe mere na mbụ ghara imekwa ọzọ. O kwuru na etu ọdị ugbua, Nwosu na-eme azụmahịa ma chebiri ntuliaka na-abịa n'ihu. Chụpadonu ndị oyindụegwu - Buratai Tukur Buratai bụ ọchịagha ndị agha Naịjirịa agwala ndị agha na-ahụ maka Operation Lafia Dole n'Adamawa steeti ka ha chụpado ndị oyindụegwu ghara inye ha oghere ikute ume. O kwuru na gọọmentị ga-enye ha nkwado ha ga-eji buso iyindụegwu agha. A kwatuola ụlọ 2500 na-adịghị mma Ngalaba Lagos State Environmental and Special Offences (Enforcement) Unit akwatuola ihe karịrị ụlọ ọjọo puku abụọ na narị ise a rụrụ na nso mmiri dị na Marwa dị na Lekki. Onyeisi ha bụ Olayinka Egbeyemi kwuru na nkwatu a bụ maka nkwado ha na-akwado ịrụ ụzọ ọzọ a ga-esi na-aga Lekki-Epe. 'Gbalahụnụ ọkụ ọgbụgba' A gwala ihe karịrị mmadụ puku iri bi nakwa bịa nlegharịa anya n'obodo Victoria dị na mba Ọstrelia ka ha kwapụ gbaa ọsọ ndụ. Nke a bụ ụzọ e si adọ ha aka na ntị makana a na-eche na ọkụ ọgbụgba na-agba ọhịa ndị dị n'obodo ahụ na-akawanye njọ. Chelsea gwọrọ Arsenal ara Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates. Ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu wee sị Arsenal 'taa kpuchie ọnụ' n'agbanyeghi na ha bụ ọbịa na be ha. Gụọ ya n'uju ebe a: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ NCC adụọla ụlọọrụ na-enye ikuku ekwenti ọdụ Teleology meriri Glo, Airtel na Alheri iji nweta ohere ịzụ 9mobile Ngalaba na-ahụ maka nhazi etu ndị ọrụ ikuku mgbasa ozi n'ekwenti bụ Nigeria Communications Commission adụọla ndị ụlọọrụ na-enye ikuku ekwenti ọdụ Ndụmọdụ a ha nyere gbasara ịnye ndị mmadụ ruo abali iri anọ na ise tupu ha si na otu igwe na-enye ikuku ekwenti fere ọzọ. N'ofesi, Ọtụtụ ndị ụka Jew juru na Monsey dị na New York Amaala mmadụ ise mma n'ụlọ onyeisi ụlọụka Jew n'obodo New York dị na mba Amerịka. Nke a na-eme dịka ndị ụka ahụ na-eme mmemme. Ndị uweojii anwụchiela onye a na-eche mere mkpa mkpa a. Amabeghị ihe mere onye a ji wakpo ụlọụka ahụ. Otu akpọrọ ""Orthodox Jewish Public Affairs Council (OJPAC)"" na asụrụ otu mma ugboro isii. Chelsea na Arsenal ga-akwata ya A ga-ama mbe nabụ nke bụ oke taa dịka Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'egwuregwu Premier League nke ga-eme n'elekere abụọ nke ehihie. Chai, onye mere Manuel Pellegrini ihe a? West Ham achụọla onyeisi ha bụ Manuel Pellegrini ọsọ ọkpa eru ala. Otu egwuregwu ahụ mere nke a k a Leicester City meriri West Ham site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ asatara otu mere ya mmeri itoolu n'ime egwuregwu iri na abụọ ha gbagoro n'izu a. A na-atụ anya na ha nwereike ị họpụta aka chiburu West Ham akpọrọ David Moyes i so na ndị nwereike inọchite anya Pellegrini. Atiku na ụmụ Naịjirịa etoola ndị uweojii Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Onye jibu ọkọlọtọ PDP zọọ oche onyeisiala bụ Atiku Abubakar etoola ndi uweojii etu ha siri mee ngwa ngwa nwuchie ndị ohị bịara ịwakpo ụlọakụ dị na Mpape, Abuja ma kwuo uru ọ bara inye ụmụ Naịjirịa ezi nchekwa n'afọ 2020 na-bịanụ. Ebe ụfọdụ ụmụ Naịjirịa kwuru na etu ndị ohi ahụ si tọkịrị n'ụlọakụ ahu dịka ihe a na-ahụ n'ihe nkiri. Nke mere ka ihe nkiri akpọrọ 'Money Heist' na-ewu na soshal midia. @FunnyAfrica na-eto onye were egwu agụrụ n'ihe nkiri ahụ wee dọnye n'onyonyo gosiri etu esi nwuchi otu n'ime ndị ohi ahụ Akinwale Adekunbi na-akatọ etu otu onye uweojii si yiri akwa na-enweghị nchekwa maka mgbọ bịa inwuchi ndi ohi bu egbe. Nzogbu, Nzogbu, Enyimba Enyi! Ndị isi pati APC nke Edo steeti na-ekwusi ike na ọ bụghị Adams Oshiomhole bụ onyeisi ha kama na ọ bụ gọvanọ na-Achị steeti ahụ ugbua bụ Godwin Obaseki ka ha ma. Onyeisioche APC N'Edo steeti bụ Anselm Ojezua kwuru na ka ọ dị ugbua akwụsịtụla Oshiomhole i bụ onyeisi APC na steeti ahụ. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?" media-46760555,https://www.bbc.com/igbo/media-46760555,Lee emume Ada siri kpọtụọ n'Aguleri,"Iji wee mepee afọ ọhụrụ 2019, ndị Aguleri ma okenye, ndị ntorobịa nakwa ụmụaka ezukọtala mee oriri Ada.","Ada bụ mmemme ha ji echeta mmeri ha meriri ndị Arochukwu n'agha mgbe ochie. Ya bụ mmemme Ada bụ nke a na-eme otu ụbọchị n' afọ bụkwazịrị oriri ha ji anabata afọ ọhụrụ. Ha na- amalite ya bụ njem Ada site na ama Igwe ebe Eze C N Idigo 1V, Eze Aguleri ga enye ha ngozi tupu ha eburu egwu na ihe ngosi di iche iche were gbagharịa ala Aguleri niile. Ụmụ okorobịa niile jikere n'ụdị eji anụ agha iji gosiputa njikere ha dị ichekwaba obodo ha. Na nke afọ a, ndị na-eme ya bụ ihe ngosi kwụrụ na ahịrị na ahịrị site na ama Igwe rue na ahịa Otuocha. Ha gara ebe akpụrụ onye nsọ Cyprain Iwene Tansi ga nara ngọzi tupu ha alaghachị n'ama Igwe. Eze CN Idigo gwara igwe n'ụmụ ndị Aguleri na ndị bịara ịgbara anya ha afọ ọhụrụ n'obodo Aguleri bụ nke agọzịrị agọzi. Ọ rịọrọ ha ka ha were udo na egwu nke Chineke were na eso ihe uwa. Otu ọgbọ dị iche iche mere ngagharị oriri Ada ahụ jikwa ịkụ ngajị n'eze wee na ezu ike." afirika-45683063,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45683063,NLC: Nke a bụ abalị abụọ agbagoro abụbụ ọrụ a,Tata bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ otu Nigeria Labour Congress (NLC) malitere abụbụ ọrụ na Naịjirịa gbaa gburugburu maka ụkwọ ọnwa opekatampe gọmentị jụrụ ibuliri ha.,"Peter Ozo Esan bụ odeakwụkwọ ndị NLC si na nnukwu ego ndị NASS na erị n'ọnwa na-ebụisi Chete na gọmentị ekwebuola nkwa ibuliri ndị ọrụ oyibo ego opekatampe n'ọnwe Septemba, mana nke a agataghịzị ka ha sị kwuo. Ya mere NLC jiri malite abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị ịzụụka abụọ. Lee ka ihe siri kwụrụ na steeti nọ n'Igbo. Abịa Nwada Agaọdichimma bụ onye achọghị ka akpọruo aha ya n'isi gwara BBC Igbo na ""ụlọọrụ nịle mechichere emechi nke bụ na ""onweghị ihe gara aga n'Abịa steeti"". Ọ sị na kemgbe ụnyahụ n'ụlọakụ nile mechichere emechi. Okwụkwara na ndị otu NLC na-agagharị ihu na ndị ọrụ nile ruwe isi na ya bụ abụbụ ọrụ. Anambra Onye ọrụ ọyibo BBC gbara ajụjụ ọnụ bụ Amaka Urigwe kwụrụ na ""ebe nile dara jụụ site ụnyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị iri na asaa n'ọnwa Septemba (27/09/18) bụ ụbọchị ya bụ abụbụ malitere n'Awka isi obodo Anambra steeti"". Ọ sị na agbanyeghị na ụfọdụ gara ọrụ ụnyahụ bụ Tọzdee ""mana ọteghị aka ha lọhachi na be ha dị iche iche, "" mgbe ndị otu NLC jị ụgbụala ha na-agagharị"". N'okwu ya, ka ọ dị tata, ndị ọrụ rubere isi na amụma abụbụ ọrụ a. Ọ sịkwa n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ mechiri emechi ọkachasị ndị nke gọmenti. Ndị ọrụ ụlọakụ ụfọdụ mepere nwantakịrị ebe ụfọdụ mechichere kpam kpam site ụnyehụ rụọ tata. Ebonyi Ozị na-eru BBC ntị na-ekwụ na abụbụ ọrụ a dị ire na Ebonyi steeti nke bụ na ndị ọrụ oyibo agaghị ọrụ. Ada Ominyi bụ ọnye lagoro ezumike nka na Ministri na-ahụ maka ahụike kwuru na ndị ụlọakụ nakwa ndị ahịa mmanụ ụgbọala azụghị ahịa tata. Ọ sịkwa na ụmụakwụkwọ agaghị akwụkwụ tata maka na ndị nkuzi ha abịaghị. Enugu Ọtụtụ ndị ọrụ oyibo BBC gbara ajụjụ ọnụ n""Enugu kwuru na ya bụ abụbụ ọrụ adịchaghị ire na steeti ahụ. N'okwu ha ""gọmentị mụtara akwụghị ha ụgwọ ma ha gbaa abụbụ ọrụ"". Charity Eze bụ otu n'ime ndị ọrụ bekee anyị gbara ajụjụ kwụrụ na ""gọmenti riri ụkwọ ọnwa m ugboro abụọ gara aga anyị gbara abụbụ ọrụ mana ndị otu NLC agbataghịrị m ọsọ enyemaka"". N'ihi ya ọtụtụ ndị ọrụ n'Enugu jụrụ isonye na abụbụ ọrụ ọbụla ebe ọbụ na a agbacha ya bụ egwụ ọ laa n'ụkwụ ha. Ọ sịkwa na ya gara ọrụ tata rụe mgbe ndị otu NLC bịara chụpụwa mmadụ n'ụlọọrụ ha. Charity kwukwere na ha ga-aga ọrụ ụbọchị Tuzde ma ọnweghị onye chụwara ha. Imo Onye nta akụkọ ""Daily Sun"" George Onyebuchi gwra BBC na ya bụ abụbụ ọrụ dị iri na Imo steeti nke bụ na ụlọọrụ nile mechiri emechi kemgbe ụnyahụ. Okwuru na nke ka njọ bụ na ndị ọrụ ụlọakụ mechichere emechị nke bụ na ọtụtụ mmadụ ahụghị ego ha ji ebi ndụ. Onyebuchi kwuru na ndị ọkwọọ ụgbala ụfọdụ apụtaghị nke mere na ndị pụtara tinye ego n'ihe eji eme njem. Nke a mere ọtụtụ mmadụ jiri were ụkwụ na-agazịri onwe ha. Onyebuchi sịrị na ""ya gara ịwere ego n'ụlọ akụ asị ya n'ego adịghị"". Ọ bụ otu a ka ya bụ abụbụ ọrụ ndị NLC kpọrọ siri kwụrụ n'igbo nke tata. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43455132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43455132,Nigerian foods: Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri,Ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri.,"A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu e were mkpụrụ ya Ụkwa nwere osisi nke na-amịpụta mkpụrụ ụyọkọ buru ibu nke Bekee na-akpọ 'breadfruit'. Azụ mkpụrụ ụyọkọ ya na-acha akwụkwọndụ akwụkwọndụ, ebe mkpụrụ mkpụrụ dị ya n'ime na-emepụta ihe anyị na-akpọ ụkwa. Ụyọkọ ụkwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapụ ya ka ọ ree ure tupu a kụwaa ya ma wepụta ụkwa nke a na-esi esi. Ya mere ndị Igbo ji asị na 'ụkwa ruo oge ya ọ daa'. Tupu e rie ụkwa, ọ ga-agabiga ụzọ dị icheiche dịka: Ngwa nri eji esi ya ""Ụkwa ruo oge ya ọ daa"" Etu e si esi ya Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu i sie ụkwa gị: Ụkwa bụ otu nri nwere ụtọ nke ya ị ga-erinwu ma ị tinyere maọbụ itinyeghị ngwanri ọbụla Etu e si eri ya A bịa n'ụfọdụ obodo dịka Urualla dị n'Imo steeti, ha anaghị azapụ mmiri e ji sie ụkwa ha. Ha na-aṅụ mmiri ya iche ma riekwa ụkwa ha iche. Ụfọdụ anaghị etinye mmanụ nri n'ime n'ụkwa ha, ebe ụfọdụ na-ahapụ mmiri ụkwa n'ime ya nke bụ na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri. A na-eghekwa mkpụrụ ụkwa eghe, jiri akị etiri eti maọbụ akị bekee taa ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ụkwa eghere eghe atagharị ọnụ Etu esi echekwa ụkwa A na-agba ụkwa n'anwụ ka ọ kpọọ tupu a gbaa ya n'akpa maka ndị ga-azụta ya iji aga ala bekee. Tupu ị sie nke kpọrọ akpọ, banye ya na mmiri site n'abalị ruo mgbe chi foro n'ụtụtụ. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ọfụma ma ghee ọsịsọ mgbe ị ga-esi ya. Ihe ọ na-enye n'ahụ Nchọpụta ndị ọkachamara sayensị chọpụtara gosiri na ụkwa nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma n'ahụ, dịka riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforụs. O nwekwara potassịọm, kọpa, iron, magnizịọm, kalshịọm, zịnkị, manganeezi, selenịụm nakwa fosforụs na vitamin C. Ọ dị mma maka mkpụrụ obi mmadụ. Ụfọdụ na-eji akwụkwọ osisi ya asacha isi maka ọ na-egbu igu isi nke bekee kpọrọ dandruff, na-akwụsịkwa ndapụsị ntutu. O nwekwara obere abụba kpụkọrọ ọnụ nke bekee kpọrọ saturated fats, kọlesterọl nakwa sodịọm. Ụfọdụ na-aṅụ mmiri ụkwa iche ebe ụfọdụ na-eri ya na mmiri ya Ihe ndị ọzọ eji ya eme ị na-amaghị Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ" afirika-47787158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47787158,Nigeria senate: APC akpachapụla ndị Igbo n'ụgbọ?,Okwu akpụ n'ọnụ ugbua bụ okwu metụtara ndị ga-apụta dịka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta.,"Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a Ka o si kwụrụ ugbua, ndị a kpụ aha ha n'ọnụ na ha nwereike ịpụta dịka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta n'agba nke a na-aba bụ ndị ugwu na ndị ọdịda anyanwụ. N'ụlọomeiwu ukwu, Ahmed Lawan bụ onye na-anọchite anya Yobe Nọt, bụ onye kepukepu si APC na-apụta na-ekwu na ọkwa onyeisi ha nwereike iru aka. N'Ụlọomeiwu nke nta, ọ bụ onye na-anọchịte anya ọgbọ vootu Surulere bụ Femi Gbajabiamila, ka kepukepu sị na ndị isi APC na-akwado. Mana, ụfọdụ ndị isi ha gbagotere n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọwụwa-anyanwụ na-ekwu na o zighi ezi ma ya bụru na APC kpachapụrụ ọwụwa-anyanwụ n'ihe na-eme. Rochas Okorocha tinyere ọnụ na ya bụ okwu mgbe ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mechara nzukọ n'obi gọọmenti n'Abuja n'ụbọchị nke mbu nke ọnwa Eprelu, 2019. Agbanyeghi nke a, APC akpọbeghị okwu aha. Ike Ekweremadu so na onye tọchara n'ụlọ omeiwu nke Naịjirịa ugbua Nke a mere ka ụfọdụ ụmụafọ ọwụwa-anyanwụ jiri soro na-ndị na-achụ nta ịbụ ndi isi n'ụlọomeiwu abụọ. Mmadụ dịka aka chịbụrụ Abia steeti bụ Orji Uzo Kalu na onye na-anọchịte anya Ụmụnneochi n'ụlọomeiwu nke nta bụ Nkechi Onyejiocha, apụtala kwuo na oche onyeisi ụlọọrụ ha ga-amasị ha. Mana, ọnụ na-ekwuchitere APC na Lagos steeti bụ Maazị Joe Igbokwe gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọwụwa-anyanwụ nọ ugbua n'ihe metụtara ọchịchị Naịjirịa si ha n'aka. ""Nwata so gbaa bọọlụ ga-eso racha oroma. Ị gaghị arụ ọrụ na UAC gawa ịnata ego UBA."" Orji Uzo Kalu ekwuola na ya chọrọ oche onyeisi ụlọomeiwu maọbụ osote ya Na nkọwa Maazị Igbokwe, onye ga-abụ onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu ga-abụ onye tara nchara n'oche. Ọ sị: ""Onweghị onye si ọwụwa-anyanwu tozuru. Asịghị na agaghi enye ya. Ọ na o tozughi makana ọ ka na-aga nke mbụ."" Igbokwe gara n'ihu kwuo na ebe ndị ọwụwa-anyanwụ dara ya bụ ebe o si metụta ịkpa nkata etu onye si mpaghara ahụ tozuru etozu ga-apụta dịka onyeisi ụlọomeiwu. ""Etu e si eme bụ edowe ya ụzọ abụọ. Ya abụghị nke a, ọ bụrụ nke a. PDP merie, kedụ ihe ga-eme? APC merie kedụ ihe ga-eme? ""A bịa na sineti, edobe mmadụ adịghị ama ama APC merie, enye onye tozuru nwereike ịpụta. ""O kwesịrị ihe a kpara akpa, ihe anyụkọrọ mamịrị ọnụ wepụta. Mana anyị were ihe niile tinye n'otu nkata. Lezienụ ihe na-eme ugbua.""" afirika-44755780,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755780,Ndị Igbo kwenyere n'ụkpụrụ 'nye anyị nke ruru anyị' - Onye ndụmọdụ Ekweremadu,Nke a bụ mbụ a na-ehibe ọgbakọ 'International Parliament for tolerance and peace (IPTP)' iji wee kwado mmekọrịta na mkparitaụka gbasara ọdimma nakwa nsogbu na-esogbu akụkụ mbaụwa dị iche iche.,"Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ Ọgbakọ a nke e mere n'izu ụka mbụ n'ọnwa Julaị n'obodo Malta họpụtara Taullant Balla nke si ụlọomeiwu Albania dịka onyeisi mbu, ebe osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka imepụta iwu na ya. Onyeisi ọgbakọ ukwu a mutara ọgbakọ nke nta (IPTP) a bụ Ahmed bin Mohammed Al-Jarwan, kwuru na dịka mbaụwa niile na-agabiga mkpasuiwe, esemokwu dị n'okpukpere, iyi egwu, ịhọ otu, oke ogbubgu nakwa ndị ọzọ, ọgbakọ a ga-enye aka iweta udo. Al-jarwan kwuru na ọ bụghịzị sọsọ na mpaghara ndị omeiwu na-anochite ka ha ga na-anwa oke ha, na ha kwesiri ịgbasapụ aka udo nye mbaụwa niile. Ihe ọkwa Ekweremadu pụtaara Obodo Naịjirịa Onye ndụmọdụ n'ụlọọrụ Ike Ekweremadu bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọhụrụ a bụ nnukwu ihe meere ndị Naịjiria nakwa ndị Igbo. O kwuru na e ji iweta udo mara Ekweremadu mgbe ọ chịburu n'ụlọomeiwu nke 'Economic Community of West African States (Ecowas)'. Anichukwu kwuru na Ekweremadu na ndị omeiwu ndị ọzọ si n'akụkụ mbaụwa niile n'ọgbakọ a ga na-atụgharị uche ma mepụta iwu dị iche iche ga-enyeaka iwebata udo na mbaụwa. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a: Etinyela udo Naịjirịa n'aka Ekweremadu ọzọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43361967,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43361967,China: E meela Xi Jinping onyeisiala ruo n'ọnwụ,China emegharịala iwu ha iji nye onyeisiala ha bụ Xi Jinping ohere ka ọ nọdụ n'ọkwa dịka onyesiala ruo mgbe ọ nwụrụ.,"China Xi Jinping nwere okike ka Chairman Mao Ndị na-anọ ka ndị ome iwu ukwu na China bụ ndị akpọrọ ""National People's Congress"" n'asụsụ Bekee megharịri iwu ha na nzụko ha mere. Ndị ""National People's Congress"" na eme nzụkọ otu ugboro n'afọ. Mmadụ atọ n'ime mmadụ 2,964 bụ ndị National People's Congress ebinyeghi aka n'akwụkwọ eji gbanwe iwu a, mana mmadụ abụọ binyere aka ekweghịekwe. Kemgbe 1990, iwu China kwuru na ọ bụ naanị ugbo abụọ ka onyeisiala China ga-anọ n'ọkwa. Mana maazi Xi, bụ onye kwesiburu ịrịtụ n'afọ 2023, akpọpụtala onye ga-anọchị ya mgbe pati na-achị China nwere nnọkọ n'ọktoba 2017. Kama, o haziri ọnọdụ ya ka pati ya weliri ọkwa ya ka ọdịrị ka nke onye muụara pati ha bụ Chairman Mao. N'akwụkwọ, ndị kongress a bụ ndị kachasị nwe ikike na China mana a na-eche na ọ ga eme ihe a si ya mee. Xi ọ ga-achị ebighebi? Nkọwa Stephen McDonell, onye ntaakụkọ BBC na China nọ na Beijing O siri ike ịhụ Xi Jinping ị nọ ka onye a na-atụ aka n'anya chacha. O wetere ikike udiri nke ahụgbeghị kemgbe oge Chairman Mao Zedong. Mr Xi kuru aka mgbe emeghariri iwu a Naanị afo ise gara aga oge Hu Jintao, ndị otu a na-akpọ ""Politburo Standing COmmitte"" na-achịkọ Beijing, ị ga-anụ ka a na-arụ maka ndị mmadụ nwere oghere ikwu uche ha. A na-eche na Maazị Hu chọrọ inye ndị ndọrọndọrọ na pati ya aṅụrị ka osikwa di kwa afọ iri ọbụla, onye onyeisiala ozọ ga-akpọrọ ndi nke ya bịa were ọchịchị n'udo. Mana site taa, ihe a niile alaala. Iwu a emegharịrị ga enye Xi Jinping ohere inọdu ka onyeisiala karịa ugboro abụọ okwesiri ịnọ, maka ha agaghị enye onwe ha udi nsogbu a ma ya bụrụ na obughị ihe ọ choro ime. A kpaghị nkata onye kwuo ụche ya tupu eme mgbanwe iwu a. Nwayo nwayọ, Xi Jinping agbanwela etu esi achi mba ya, wee tinye onwe ya na etiti ihe niile." afirika-49372229,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49372229,Ibrahim El-Zakzaky: Ihe kpatara anyị ji kpọlata nwa amadị a - Gọọmentị Naijiria,Gọọmentị Naijiria akọwaala na ọ bụ agwa ọjọọ Ibrahim El-Zazaky na nwunye ya kpatara e ji si na mba India kpọghachite ha.,"Ibrahim El-Zakzaky n'ime ụgbọelu bu ya aga India El-Zakzaky na nwunye ya hapụrụ Naijiria ụbọchị Mọnde abalị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọst, gawa India ịga leta ahụike ha anya dịka otu ụlọikpe dị na Kaduna siri nye n'iwu. Mana ha abụọ lọghachitere Naijiria taa bụ Fraide. Dịka akwụkwọ ọzị si n'aka ngalaba gọọmentị n'ahụ maka mgbasa ozi na omenala siri kwuo, El-Zakzaky na nwunye ya chọrọ ibute nghọtahie na esemokwu n'etiti Naijiria na India. Grace Isu Gekpe bụ onye binyere aka n'akwụkwọ ozi ahu kwuru na El-Zakzaky chọrọ iji ụzọ aghụghọ hapụ India gaa obodo ọzọ. Gekpe dere sị: ""Mgbe ha garuru India, El-Zakzaky kpọtụụrụ ndị ọkaiwu nke ndị ndu ha bụ Ali Zia Kabir Chaudary na Gunjan Singh. Ibrahim El-Zakzaky ""Ọ kpọtụkwara ndị otu ""Islamic Human Rights Commission"" nakwa ndị otu ""Shiite"" ndị ọzọ. ""Ebumnuche ya bụ ịchọ ụzọ ọ ga-eji si India gafee mba ọzọ. ""Nke a gaara abụ nnupu isi n'iwu nke ụlọikpe Kaduna nyere tupu ọ hapụ Naijiria gawa India."" Gọọmentị Naịjiria kwukwara na El-Zakzaki chọrọ ịnọ n'ụlọ oriri na nkwari na India kama ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ. ""O doro anyị anya na El-Zakzaky nwere ihe ndị ọzọ ọ na ede na-abụghị ihe gbasara ahụike, nke a mere ka anyị kpọghachite ya na Naijiria."" Cheta na mgbe El-Zakzaki na nwunye lọbatara n'ogige ụgbọelu dị n'Abuja, e si n'akụkụ ogige ugboelu ebe onyeisial na-esi abata wee kpọpụ ya ka ndị ntaakụkọ ghara ịma na ọ batala. Ndị ntaakụkọ nọ na-eche mgbe El-Zakzaky ga-abata. Ndị ọrụ nchekwa gbakwara ogige ụgbọelu ahụ gburugburu tupu ụgbọelu bu El-Zakzaky na nwunye ya efetuo. Ndị ọrụ nchekwa juru n'ogige ụgbọelu dị n'Abuja mgbe El-Zakzaky batara Cheta na El-Zakzaky e kwubuola na 'gọomentị Naíjiria tụgidere ya asị' mgbe ha gwara ndị ụlọọgwu India na ha amaghị ihe na-arịa ya. O kwuru na ọ bụ ọgwụgwọ ka ọ biara ịnata n'India, n'ihi na e mechaala ya nnyocha na Naịjirịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ" egwuregwu-43359522,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43359522,Egwuregwu bọọlụ: Dịka o si gaa n'asọmpi nke taa,"Enwere asọmpi n'etiti ọtụtụ egwuregwu bọọlụ dịna mba Yuropụ dị icheiche site na mba Ingụlandị, Sụpenị, Fụransị n'akwa Jamịnị.","Rashord nyere goolu abụọ n'asọmpị ha ndị Liverpool Ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ gosiri ihe ha jiri bụrụ ọka ibe, ebe ndị ọzọ gbara ọnyụpa. Lee dịka ọ jiri gaa n'ụfọdụ asọmpị ndị ahụ na nchịkọta; Na mba Ingụlandị, otu Manchester United ji goolu abụo asatara otu merie ndị Liverpool, Everton gbara ndị Brighton ọkpụ goolu abụọ, onweghị onye nyere goolu n'etiti ndị Huddersfield na Swansea. Ọkpụ goolu iri na atọ nke Willian n'afọ a Newcastle meriri ndị Southampton site na-inye ha goolu atọ a na-asataghị otu, Leciester jiri ọkpụ anọ asatara otu merir ndị west Brom, Burnley jir goolu atọ merie ndị West Ham, ebe Chelsea jiri goolu abụọ asatara otu merie ndị Crystal Palace. Na mba Sụpenị, Real Madrid nyere ndị Elbar goolu abụọ asatara otu, Valencia jiri goolu abụọ merie ndị Sevilla, Levante jiri otu ọkpụ merie ndị Getafe, dịka ọ na-aga n'ịhụ ugbua Barcelona na Malaga ka na-agba. Ronaldo nyere ọkpụ goolu abụọ na mmeri ndị Real Madrid meriri Elbar Na mba Fụransị, Paris Saint Germain jiri ọkpụ ise merie ndị Metz, ebe ndịọzọ ka na-aga n'ihu ugbu a. Bayern tụrụugo n'asọmpi ha nke taa A bịa na Jamịnị, Bayern Munich nyere Hamburgher ọkpụ isii, Ausburg meriri Hannover n'ọkpụ atọ asatara otu, Hertha Berlin na Freiburg emerighi ibe na nke ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56944969,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56944969,"Ofo Igbo: Ihe dị iche na ọfọ, ọfọ ndị ichie na mkpụrụ ọfọ",Ọfọ bụ osisi a na-ahụta nanị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ndị sayensị na-akpọ ya Detarium Senegalense.,"Ndị Igbo kwenyere na onye ọbụla ji ọfọ ga-abụ onye aka ya kwụ ọtọ Mgbe ọbụla ọfọ batara n'obi onye Igbo, ọ bụ osisi eji mara ndị Ichie, Nze maọbụ Ọzọ. Mana n'ala Igbo, a na-ejikwa mkpụrụosisi ọfọ esi ofe. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche na o nwere ndịiche n'etiti osisi ọfọ na ọfọ nke e ji esi ofe. Iji wepụ nghọtaghie a, BBC Igbo kpọtụrụ Chigozie Nnabuihe onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ala Igbo, ka ọ tinye ọnụ na ya bụ okwu. Ọkammụta Nnabuihe bụ onye nkụzị asụsụ na Omenala Igbo na mahadum gọọmentị etiti nke dị na Legọs steeti. Lee etu ya bu mkparịta ụka maka ọfọ siri gaa Ọfọ Ọkammụta Nnabuihe kwuru na osisi ọfọ bụ osisi bụrụ ibu dịka ọsịsị Apụ, Ụgba maọbụ Ọji. O kwukwara na ndị Igbo nyere ọfọ ọnọdụ dịka osisi eji ekwu eziokwu, ikike e ji akwụrụ n'ụzọ eziokwu na ikike eji ahụ na enweghị onye a na-emegbu. Ọ kọwara na ọ bụ ya mere ndi Igbo ji ekwu, "" O ji ọfo ga-ala"". O kwuru sị. ""Ndị ọcha amaghị ihe ha ga-akpọ osisi ọfọ. Ọ bụ nanị n'ọdịda anyanwụ Afrịka ka a na-enweta osisi ọfọ"". Nnabuihe kọwara na dịka ụdara na ụfọdụ osisi ndị ọzọ, na anaghị ata ya ata kama eji ya esi ofe. Ọ kọwara si ""a na-eji mkpụrụ ime ya esi ofe, eji ya eme ka ofee rọọ arọ."" Nnabuihe kwuru sị na onye chọrọ ịmetọ ọfọ ga, ""e nwere osisi a kpọrọ agbalị kee n'ukwu ọfọ, mgbe e mere nke a, mkpụrụ niile nọ na ya bụ osisi ga-adasịsị n'ala"". Kedụ etu esi enweta osisi ọfo nke ndị ichie na-eji n'aka? Gịnị bụ ọfọ? Nnabuihe kwuru na e nwere usoro e ji enweta osisi ọfọ nke ndị Ichie na-eji. Ha gụnyere: Ihe dị iche na Ọfọ, mkpịsị ọfọ na osisi apịrị apị Ukwu osisi ọfọ Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ọfọ bụ mgbe mmadụ soro usoro anyị depụtara na mbụ, nke bụ na Ojiọfọ awakeela ya. O kwuru sị, ""ụfọdụ na-aga tụtụrụ osisi ọfọ ha hụrụ n'ala na-esoghị usoro mwaake, ihe a na-ekwu bụ na onye ahụ ji mkpịsi ọfọ"". Kama Nnabuihe kọwara na onye gara were mma gbute ọfọ nke ya, ihe ana-ekwu bụ na onye ahụ ji osisi apịrị apị. Ọfọ nke anaghị ahụ anya N'asụsụ Igbo, mmadụ iji ọfọ pụtara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ, ikwu eziokwu, nakwa izere ihe ọjọọ. Ndị Igbo na-ekwu okwu dịka: ""Ejikwaara m gị ọfọ na ogu"", ""Ihe onye na-eme ya jidekwa ọfọ"", dịrị gawazie. Mgbe a kpọrọ ọfọ n'ụzọ dị otu a, ọ pụtaghị ọfọ nke a na-ahụ anya, kama ọ bụ iji gosi eziomume. Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị Na nchịkọta Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị, ""Ọ bụ osisi ọfọ mịtara mkpụrụ nke e ji esi ofe ma ọ bụ kwa alaka ya ga-eji mere ọfọ ndị ichie"". Ọ chịkọtara ya were si, ""Ọfọ bụ ike, ọfọ bụ ndụ, ọfọ bu Igbo""." afirika-46168808,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46168808,Christy Essien-Igbokwe: Nwaanyị a lụtara na mba bịara bụrụ Ada Igbo ji eme ọnụ,"Ọ bụrụ na a jụọ ụfọdụ ndị ntorobịa taa onye tiri egwu a kpọrọ ""Tetanụ n'ụra"", ọtụtụ n'ime ha agaghị ama onye ọ bụ, nke a bụ ihe ọnwụ mere anyị.","Christy Essien Igbokwe wuru ewu n'afo 1980 gbadatawa 2000 Maka na ọ bụrụ na Christy Essien-Igbokwe ka dị ndụ taa, olu ogene ya ka ga na-ada n'igwe redio nakwa TV dị icheiche. Taa bụ abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020, ka otiegwu Christy Essien-Igbokwe gaara agba afọ iri isii, mana ya dịba. Onye bụ Christy Essien-Igbokwe Efere egwu a bụ nke kacha ree ahịa n'egwu niile Christy Essien-Igbokwe tiri Christy Essien-Igbokwe so n'ụmụnwaanyị otiegwu a nụrụ aha ha anụ na Naịjirịa. Nne na nna ya bụ ndị Akwa Ibom steeti, mana o toro n'ala Igbo, n'aka otu enyi nne ya, maka na nne ya nwụrụ oge ọ gbara naanị afọ iri na abụọ. Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị n'Aba, Abia steeti, ebe ahụ ka ọ nọ malite ịgụ egwu. O mechara lụọ di onye Igbo, aha ya bụ Edwin Chukwunenye Igbokwe, onye Awka n'Anambara steeti, etu a ka o si bụrụzie onye Igbo kpọmkwem. Ha mụtara ụmụ anọ ma nwee ụmụụmụ atọ tupu ọ laa mmụọ. Di Christy Essien-Igbokwe na ụmụ ya n'emume akwamozu ya nke e mere n'abalị iri nke ọnwa Sepụtemba afọ 2011 Otu n'ihe Christy Essien-Igbokwe ji bụrụ ọpụrụiche bụ maka na ọ na-asụ ọtụtụ asụsụ na-abụghị asụsụ nne na nna ya bụ Efik. O tiri egwu n'asụsụ Igbo, Hausa, Yoruba, Efik, Ibibio nakwa Bekee. Nke a mere e ji akpọ ya 'Nigeria's Lady of Songs'. Egwu ya ndị mmadụ kacha mara bụ nke o tiri n'asụsụ Yoruba, ọ kpọrọ 'Seun Rere', nakwa nke o ji Igbo tie ọ kpọrọ 'Tetanụ n'ụra'. Efere egwu a bụ nke kacha ree ahịa n'egwu niile Christy Essien-Igbokwe tiri Nwa ada a sokwa na ndị hibere otu ' Performing Musicians Association of Nigeria' (PMAN) n'afọ 1984. O mechara bụrụ nwaanyị mbụ chịrị otu ahụ malite n'afọ 1996 ruo 1999. Efere egwu ya nke ọ kpọrọ 'Ever Liked my Person' bụ ya kacha ree ahịa. Ndị ma anya egwu kwuru na ya bụ egwu rere karịa otu nde bụ nke Bekee kpọrọ 'platinum'. Lee efere egwu niile Christie Essien-Igbokwe tipụtara na ndụ ya: Christy Essien Igbokwe na ime ejije Christy Essien-Igbokwe dịka Akpeno n'ejije 'New Masquerade' Iji gosi na ọ bụ gbazuo agụ, Christy Essien-Igbokwe sonyere ndị otu ejije a kpọrọ 'New Masqurades' Ọ bụ ya bụ nwunye Jegede Sokoya na ya bụ ejije nke wuru ewu na Naịjirịa niile n'oge ahụ. E nwere ike ikwu na ọ bụ otu ejije a nke Christy Essien-Igbokwe so na ya hibere ntọala maka ngalaba ejije Naịjirịa bụ Nollywood taa. Oge Nollywood malitere, nwa ada a sokwa mee ejije ụfọdụ dịka 'Flesh and Blood' na 'Scars of Womanhood'. Orụ ndị ọzọ Christy Essien-Igbokwe Christy Essien-Igbokwe gbara mbọ maka ịkwalite ọnọdụ ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị na Naịjirịa. O so na ndị hibere ulọọrụ a kpọrọ 'Essential Child Foundation' n'afọ 1992, mana ọ malitere ọrụ na 1994 Ọrụ ha bụ inyere ụmụaka enweghị nne na nna aka. N'afọ 2013, Edwin Igbokwe bụ di Christy Essien-Igbokwe gụgharịrị ụlọọrụ ahụ aha, kpọzie ya Christy Essien Igbokwe Memorial Foundation (CEIMF) Gọọmentị Naịjirịa nyekwara ya nturuugo pụrụ iche a kpọro 'Member of the Order of the Federal Republic' (MFR). Ihe ndị ọzọ dị mkpa gbasara Christy Essien-Igbokwe Ụlọorụ Google kwanyeere Christie Essien-Igbokwe ugwu pụrụ iche n'afọ 2018 Ndị ụlọọrụ Google mere esere ese ha na-akpọ ""doodle"" iji chetara ụwa maka ụbọchị amụrụ Essien-Igbokwe bụ nwaanyị nwere olu ụtọ ka nnụnụ. BBC jụrụ nwa ya bụ Kaka Igbokwe ihe ndị mmadụ amaghị maka nne ya, o kwuru sị ""ụwa niile amaghị na ọ bụ onye dị obiumeala. ""Ụbọchị ncheta ọmụmụ ya kwa afọ, ọ na-esonye ndị nwaenwenne nakwa ndị ụbịam eme emume ya. ""Ọtụtụ oge o mere emume ncheta ọmụmụ ya, ọ bụ ndị mmadụ ji ego ha mee ya. ""Ndị bi n'obodo nna m n'Ọka dị n'Anambara steeti ma ya ọfụma ọfụma. Ọ na-esi nri ndị Igbo ma na-asụkwa asụsụ anyị ọfụma karịa ụfọdụ ndị Igbo."" Ihe ị kwesịrị ịma maka Christy Essien-Igbokwe Google emekwaala ndị Igbo dịka Chinua Achebe, Flora Nwapa nakwa Stephen Okechukwu Keshi ""doodle"" a ụbọchị ncheta ọmụmụ ha. Achebe bụ ụbọchị 16 nke Nọvemba 2017, nke Nwapa bụkwa n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị 2017, ebe nke Keshi bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenụwarị 2018. Essien-Igbokwe so n'ụmụnwaanyị ndị egwu ha mere ndị mmadụ obi aṅụrị na Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-47341645,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47341645,"Man United vs Liverpool: Ha agbọghị ụja, ha ataghị arụ",Liverpool gara zute Manchester United na be ha bụ Old Trafford ebe ha kụkọtara isi ka ebule abụọ na-alụ ọgụ.,"Ruo oge e gbuchiri bọọlụ, enweghi onye nyere goolu n'etiti ha abụọ, n'agbanyeghi na a gụfuru goolu Chris Smalling gbakpuru na neetị makana o bi ebi na nso poostu. N'ime ọkara iri abụọ e ji bido bọọlụ, Man Utd gbanwere ndị nke ha bụ Juan Mata nakwa Ander Herrera, maka mmerụahụ. Ka Herrera pụrụ, e ji Andreas Pereira tichie ya, ma werekwa Jesse Lingard tichie Mata mgbe ọ pụrụ. N'otu aka ahụ, Liverpool gbanwekwara Roberto Firminho maka mmerụahụ ma kpọbata Daniel Sturridge iji tichie ya. Na nkeji iri anọ, Lingard riri 'nri Chinyere' Romelu Lukaku bunyere ya, ka Alisson Becker ghọrọla ya n'aka ya. Isi Solskjaer ọ ga-apụtakwa taa? Na-erughi nkeji 17ọ batara na nkeji abụọ Lingard richara goolu n'ihu poostu, ọ pụrụ n'ọgbọ egwuregwu maka mmerụahụ; nke bụ na Man Utd agbanwechaala mmadụ atọ ha nwere. E webatara Alexis Sanchez iji gbanwee ya. Ọzọ bụ na Liverpool ejiela bọọlụ ihe ruru pasentị iri isii, ebe Man Utd ji ya pasentị iri anọ. Gịnị ga-eme ma Liverpool chakee? N'ọkara abụọ, Liverpool wepụrụ Jordan Henderson, were Xherdan Shaqiri tichie ya; nke a wutere ya, ọ gwara Klopp bụ onye nchịkọta ha ihe anyị anụghị iji gosi na obi adịghị ya mma. Ewepụrụ Salah bụ onye egwu Liverpool na nkeji 78 makana agha a riri ya, ma webata Divock Origi." afirika-51166314,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51166314,Rice meal on Sunday: Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka,"Osikapa n'ụbọchị ụka, o na-egbukwanụ oge? Mbanụ ka ndị Igbo ga-aza gị.","Ma anyị na-ede akụkọ a, na-elegara anya ka anyị ga-esi riwe osikapa nke ụbọchị ụka. Osikapa bụ otu nrị ụmụ Naịjirịa ejighị egwu egwu tụmaadị ụbọchị ụka. Ha nwere ụzọ ole na ole ha si eri ya bụ nri. Ụfọdụ ndị na-eji ofe akwụ, ofe tọmato, jọlọf, maọbụ eghere eghe wee hazie ya. Kedụ ka o si malite? Ọkammụta n'ihe gbasara nri bụ dọkịta Florence Uchendu kwuru na oriri osikapa ụbọchị ụka na Naịjirịa enweghị ụbọchị a ga-asị na ọ malitere iche. Kama na a na-ahụta ya bụ nri ka nri ndị ọgaranya mgbe gboo mere na mmemme ọbụla ị gara a na-ejikarị ya ele ndị ọbịa mgbe ahụ. O kwuru na ugbua ya bụ nri abụrụla omenaala tụmaadị na mmemme maọbụ ụbọchị ụka ọbụla n'ala Igbo nakwa Naịjirịa. Gịnị kpatara nke a? Dọkịta Uchendu kwuru na ihe ndị a bụ ihe o chere mere ka a na-erikarị osikapa ụbọchị ụka. Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru O nwere ọghọm dị na ya? O kwuru na o nweghị ọghọm dị ya kama na ebe nsogbu dị bụ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ na-eri osikapa ụtụtụ, ehihie nakwa abalị kwa ụbọchị. N'ọnụ ya, ""ahụtaghị omenaala iri osikapa dịka nke nwereike ịkwụsị belụsọ osikapa alara kpam kpam."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" afirika-54641614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54641614,End SARS: Ndị ekperima etinyela ndị mmadụ n'ụjọ n'ụfọdụ obodo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ,Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụjọ nakwa ize ndụ n'ogbe dị na steeti dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka ụfọdụ ụmụokorobịa weghaara ngagharịiwe 'End SARS' ma mezie ya ka ọ ghọọ nnukwu ọgbaghara.,"Ụlọọrụ ndị uweojii a gbara ọkụ n'Imo steeti N'Enugwu, Abia nakwa ebe ụfọdụ n'Imo steeti, ndị ntaakụkọ BBC kwuru na ụmụokorobịa wakporo ọtụtụ ụlọọrụ nakwa ụlọahịa, mebie ihe ndị mmadụ ma zurukwa ọtụtụ ihe. Ndị mmadụ chịzị obi ha na-aka n'Enugwu Ndị omekomekuriri ụfọdụ ihe akpụrụkpụ e ji chọọ Enugu mma Ọgbaaghara kawanyere njọ n'Enugwu n'ụbọchị Tọzde mana BBC chọpụtara na ya bụ ọgbaaghara esighị n'aka ndị na-eme ngagharịiwe 'End SARS'. Anyị hụrụ ụmụokorobịa ka ha mechiri ụzọ Enugwu niile na-anakọ ndị mmadụ ego. Malite n'Ogui Road gawa Emene ị ga-ahụ ihe karịrị 'checkpoint' iri abụọ na ise ebe ndị ntorobịa gbachiri ụzọ. Ndị nọchiri ụzọ jicha mma, osisi na egbe na-anapụ ndị mmadụ egotupu ha ekwe ka onye ọbụla gafere. Ha mụnyechara ọkụ n'ebe ụfọdụ iji meche ụzọ Ọtụtụ n'ime ha na-aṅụ anwụrụ ike na mmanya ga-ajụ gị ma ị bụ onye Naijiria ka ọ bụ Biafra, ọ bụrụ na ịzaghị ihe ha chọrọ, ha nwere ike imeru onye ahụ ahụ. Ha mebikwara ọtụtụ ụgbọala nwere ihe dịka ọkọlọtọ Naijiria maọbụ nke ndị 'Road Safety', ma na-ekwu na ha achọghị ihe Naijiria ọbụla. Mana ndị agha kwụrụ chịm n'ihu ọdọụgbọelu Akanụ Ibiam Enugwu ma kee nkwụcha n'ihu ebe ahu iji gbochie ndị ntorobịa ahụ ịbanye na ya. Ọtụtụ ụlọakụ dị n'Enugwu ka ndị omekome ahụ kuriri ma banye n'ime ya buruchaa ihe. Ndị ekperima kuriri ọtụtụ ụlọakụ n'Enugwu Ha gụnyere: First Bank Emene, First bank Presidential Road, Access bank Presidential Road, Access bank Agbani Road site Nise, First Bank Agbani Road site Nise, First Bank Abakpa, nakwa ọtụtụ ọba ego ndị ọzọ. Iji maa atụ, n'ụlọakụ 'First Bank dị n'Abakpa, ha bukọsịrị igwe ntụ oyi (air-conditioners), igwe kọmputa, igwe laptop, oche, nakwa tabulu, ma wufusịa akwụkwọ ndị ụlọakụ ahụ n'iro. Mana BBC ejighi n'aka ma ha abanyere na ebe a na-akpọ 'strong room' n'ụlọakụ ahụ nke bụ ebe a na-edebe ego. Ọtụtụ igwe ATM ka ndị ekperima ahụ kurikwara Ka ọ dị n'ụtụtụ tata bụ Fraịda 23 October, mgbo egbe adawakwala ọzọ. N'Asata, ụfọdụ ndị bi n'ogbe Secretariat Quarters gwara BBC na ha tetara ụra were hụ na ụmụokorobịa karịrị iri anọ ezukọọla n'ogbe ha, buruchaa egbe, mma na okpiri nakwa ọkọlọtọ Biafra. Mana o teghị aka, ndị uweojii na ndịagha bịara chụsasịa ha. Ka ọ dị u, ndị mmadụ ji nwayọọ n'enyo iji mara etu obodo si dị. Obodo ederela jimjim n'Abia steeti Ndị ntorobịa mụnyere ọkụ n'isi ụlọọrụ Aba North A nụrụ ụda egbe ebe o buru ibu n'obodo Ụmụahia, isiobodo Abịa steetị n'ụbọchị Tọzde dịka ndịagha na ndị uweojiii gbalịrị igbochi ndị ntorobịa na-akpa aghara. Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụda egbe karịrị akarị n'ihi na kepukepu kwuru nandị ntorobịa ahụ chọrọ ịwakpo ụlọ mkpọrọ dị n'Umahia. Ụda egbe ahụ dara ihe dịka awa atọ tupu ọ dajụọ. N'Aba, ndị ekperima wakporo ụlọakụ dị icheiche ma mebisie ihe ebe ahụ. Ụlọakụ nke a metụtara bị 'First Bank' na 'Union Bank' na ụfọdụ ndị ọzọ. Ha wakpokwara ụlọ 'Aba Town Hall' nakwa 'Fire Service' ma mebie ihe. 'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa' Ndị ekperima wakpokwara ahịa ebe a na-ere ịyabasị ma mebie ngwaahịa ndị mmadụ. Ka ọ dị ugbua, o nweghị onye gara ahịa maọbụ ọrụ dịka gọọmentị tinyere iwu mmachi mkpagharị. Ọtụtụ ka chị obi n'aka na-eche ihe ụbọchị ga-eweta. Mana gọvanọ Abia State bụ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka e hiwe kọmitii ga-agụkọ ngwo ngwo gọọmentị na nke ndị mmadụ e mebiri n'oge ọgbaghara a maka ibido rụziwe ha. Gọvanọ Ebonyi ebutuola mmachi mkpagharị Ihe adajụtụla ugbua n'Ebonyi steeti dịka gọvanọ Dave Umahi wetulatara mmachi mkpagharị o tinyere na steeti ahụ. Ugbua, mmachi a ga-amalite n'elekere asatọ nke abalị ruo elekere asatọ nke ụtụtụ. Mana ụfọdụ n'ekwu na a kpọchiri ụzọ akpọchi na mpaghara Kpirikpiri. Ọtụtụ ụmụnwaanyị nọzi n'iro azụ ahịa ha n'Ebonyi steeti dịka gọvanọ nyere iwu ka ahịa niile mechie Ọ bụ eziokwu na ahịa emepeghi taa, mana ụfọdụ ụmụwnwaanyị pụtara ahịa. Ndị gwara BBC okwu kwuru na obi adịghị ha mma etu e si kpọchie ahịa n'ihi na o metụtara ebe ha si enweta ihe oriri. Egwu ka dị n'Owere n'ihi ọgbaaghara Ụlọọrụ ndị uweojii a gbara ọkụ n'Imo steeti Obi ka koro ndị mmadụ bi n'Owere n'elu n'ihi mkpamkpa ndị omekome na-akpa kamgbe ọgbaaghara dapụtara nke sitere na ngagharịiwe End SARS. Nke a bụ n'agbanyeghi ihe onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n'abalị Tọzde sị ndị mmadụ garawa mkpa ha. Obi iko n'elu a bidoro mgbe kepukepu kwuru na e gburu ndịagha abụọ ma gbaa ụlọ ndị uweojii ọkụ na mpaghara Nworieubi nke dị na kansulu Mbaitolu. Mana BBC amatabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. Ihe ndị ekperima mebichara n'ọgbaaghara N'agbanyeghị iwu onye apụtala ezi nke gọvanọ Hope Uzodinma tinyere iji gbochie ọgbaghara ahụ, ụfọdụ ndị ntorobịa ka ji ohere a anapụ ndị mmadụ ego n'ụzọ.A na-ele anya n'ọtụtụ ndị mmadụ ga-ekute ume ndụ dịka ndị uwe ojii nke steeti ahụ fooro ntutu taa na ha ga-ebido itinye iwu a gọvanọ steeti ahụ tinyere n'ọrụ iji chekwaa ndụ na akụnụba ndị mmadụ. Anambara dara jụụ ugbua Etu Ọka dị taa Anyị chọpụtara na ihe adatụla jụụ n'Ọka, isi obodo Anambara steeti, nakwa n'Ọnịcha. Oge onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n'Ọka, okporo ụzọ tọgbọ chakoo dịka ụlọ ahịa niile gbachiri agbachi. Otu onye anyị gbakwara ajụjụ ọnụ sị na mpaghara ebe o bi na 3-3 Ọnịcha, dara nnọọ jụụ karịa etu ọ dị ụbọchị Tọzde. Cheta na gọvanọ Willie Obiano tinyere mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile. Ihe nkiri ga-amasị gị: Chibuike Amaechi: 'Ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịwe End SARS na-enweri anụrị'" afirika-44179183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44179183,Ndi nwụru na-ọdachị ụgbọelu Cuba eruola 100,"Ihe karịri mmadụ 100 anwụọla n'ụgbọelu Boeing 737 dara na akụkụ ọdọ ụgbọelu Jose Marti nke dị na isi obodo Cuba bụ Havana ụnyaahụ, dịka ụlọ ntaakụkọ nke gọọmentị ha kwuru.","Ụgbọelu a kpọkasịrị mgbe ọdara Mmadụ atọ pụtara n'ime ụgbọelu a mana ha merụru ezigbote ahụ, nke mere na-amabeghị ma ha a ga-anya ndụ. Ụgbọelu a bu mmadụ 110 tinyere ndị nya ya mgbe ọkpọkasịrị. Ụgbọelu a dara na ehihe ụnyaahụ ka ọ na-aga obodo Holguin na mba ahụ. Ụgbọelu a kpọkasịrị mgbe ọdara ""Ihe mberede ụgbọelu tara akpụ. Akukọ abughi akụkọ dị mfe, ọkachasị etu ndị ometụtara karịrị,"" onyeisiala Cuba bụ Miguel Diaz-Canel kwuru mgbe ọ gara ebe ọdachị a dara. Ndị nwe ya bu ụgboelu bụ ọlụọrụ Aerolineas Damojh bụ ndị Mexico, mana ha bunyere ya ụlọọrụ Cubana de Aviación bụ nke gọọmentị Cuba nwe. A zọpụtara ụmụnwannyị ato n'me ụgbọelu a Ndị Mexico na-akọwa na ọ bụ n'afọ 1979 ka arụrụ ya bụ ụgbọelu, na-akọwakwa na emere ya nyocha n'ime ọnwa Novemba nke afọ 2017. Ụgboelu a dara ka ọ na-achọ ịfepụ gawa njem ya. Ndị mmadụ gbagara ịhu ihe mere dara ezigbote ebube Otu onye hụrụ mgbe ihe ahụ mere bụ Jose Luis, bụ onye gwara ndị AFP na ya hụrụ mgbe ụgbọelu feniri elu were tụgharịa daa. ""ihe a tụrụ anyi n'anya,"" Luis kwuru. Na nyọcha ndị ọrụ ụgbọelu mere, ha chọputara na afọ gara aga bụ nke kachasị mma na njem ugbọelu makana onweghi ụgbọelu nke na-ebu ndi njem dara mancha. Mana n'ime afọ a enwela mgberede ụgbọelu bu ndị njem atọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43866790,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43866790,Kedu uru Naịjirịa na-erite na CHOGM?,O tebeghị aka e mechara ọgbakọ CHOGM nke 2018 mana ọtụtụ ndị Naịjiria ka na-ekwu maka ihe ndị mere ebe ahụ.,"CHOGM nke afọ 2018 mere na Winsdor dị na England Ha akatọla ihe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru gbasara ndị ntorobia. Mana ụfọdụ ka a na-ajụ uru Naịjirịa na-erite na ya bụ ọgbakọ? Maazi Sam Olisah onye ọkachamara n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị gwara BBC Igbo na onweghị uru Naịjirịa na-erite na ya bụ ọgbakọ. O kwuru na kama onyeisiala ga-ana ga ya bụ ọgbakọ na ọ ka mma ka ọ nọdụ ala gbo mkpa ndị na-esogbu Naịjiria dika nsogbu nchekwa na agụụrụ.Onuorah kwuru na Britein bụ onyeisi CHOGM nwere ọtụtụ nsogbu dika okwu Brexit nakwa nwakpo ndị oyi egwu nke ha ka na-achọ ka -esi egbo. Mana onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mba na mba bụ Sharkdam Wapmuk kwuru na enwere ihe ole na ole Naijiria na-rite na ọgbakọ a . Wapmuk kọwaputara ihe ndị a: Na ngwucha Wapmuk kwuru na tupu ndị mmadụ a sị ka Naịjirịa gbachapụ ya bụ ọgbakọ ,ekwesiri i nyocha uru niile a mara ma nke ukwu akariri nke obere uru dị na ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46277148,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46277148,Tosyn Bucknor: Ihe ị kwesiri ima maka ọrịa ọbara nko,"Tosyn Bucknor bụ onye ntaakụkọ ama ọfụma na Naịjirịa, nke mere ọnwụ ya jiri bụrụ ihe ọha na ama ji akparịta ụka na sochal midia.","Tupu ọ nwụọ, Tosyn Bucknor na-arụ ọrụ n'Inspiration FM. Akụkọ pụtara maka ọnwụ nwaanyị a kwuru na ọ bụ di ya hụrụ ozu ya mgbe ọ natara ọrụ n'abalị ụnyaahụ bụ ụbọchị 19 n'ime ọnwa Nọvemba 2018. Nwanne ya nwaanyị bụ Funke Bucknor-Obrute dere na Facebook na ihe gburu nwanne ya nwaanyị bụ ọrịa ahụ Bekee kpọrọ Sickle Cell. Ndị mma Tosyn Bucknor ma ya ka onye na-agụ egwu kpọrọ onwe ya Contradiction, ma makwara ya dịka onye ntaakụkọ redio akpọrọ Area Mama. Ka ọ bụ eziokwu na ọrịa ọbara nko na-arịa nwaanyị a, ọ na-agba mbọ n'ọrụ ya nakwa ime ihe banyere nka n'ụzụ. Ọ dị afọ 37 mgbe ọ nara mụọ. Gịnị bụ ọrịa a Bekee kpọrọ 'Sickle Cell'? Dọkinta Mcginger Ibeneme kọwara BBC ihe bụ ọrịa Sickle Cell nke ọ sị na Igbo gboo na-akpọ ọbara nko, okponọbara maọbụ ọrịa ogbanje. O sị na o so n'ime ọrịa ndị a na-enwete site n'aka nna na nne. Lee ihe dị ọzọ ọ Dọkinta Ibeneme gwara anyị maka ọrịa a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44125614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44125614,A kpọpụrụ Zakzaky ụlọikpe na Kaduna,E highariala ikpe onyeisi ndị Shi'a na Naịjirịa bụ Ibrahim el-Zakzaky n'ọnwa Juun 21.,"Zakzaky mgbe a kpọtara ya n'ụlọikpe A kpụpụtara el-Zakzaky na nwunye ya n'ụlọikpe dị na Kaduna n' ụbọchị Tuuzde. Ndị kpọrọ Zakzaky gawa ụlọikpe bụ gọọmenti Kaduna bu ndị na ebo ya ebubo na o gbụrụ onye agha Naịjirịa mgbe ndị na eso ya na ndịgha nwere nsogbu n'afọ 2015. Mmadụ abụọ ọzọ eji aka bụ Yakoub Yahaya Katsina na Sanụsi Abdulkadar Koki apụtaghị n'ụlọikpe ta. N'ụlọikpe, agụọrọ Zakzaky ebubo a na-ebo ya, mana o kwuru na aka ya adịghi na ya. Maxwell Kenyon, bụ onye ọkaiwu Zakzaky, si ka ulọikpe nye ohere igbapụta ya na mkporo, mana ọkaikpe ekweghị. Ọkaikpe Kurada si ka Kenyon de ihe ọchọrọ ede. Onye nọchịtere anya ndị gọọmentị Kaduna sị ka ụlọikpe kwere ka DSS ka jide Zakzaky. Ọlụikpe kwenyere na nke a, sị ka akpọghachie Zakzaky Abuja. Ụlọikpe gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun ka ha ga etinye ọnu ọzọ n'ikpe a. Mana, ndị Shi'a si na ha ekweghị n'ije a mere. N'akwụkwọ ha dere, Abdulhamid Bello, bu otu n'ime ndi isi ha, kwuru na ha ga aga n'ihu na-eme ngaghari iwe ha. ""Ọ bu gọọmentị etiti ka anyị ga ata ụta ma ya bụrụ na onwere ihe mere Zakzaky,"" Bello kwuru." afirika-46061706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46061706,Canada ga-enye ndị Naịjirịa enweghị akwụkwọ ọsọ,Mba Kanada sị na ọ ga-abụzị 'kwapụ kwapụ' ka ha ga-eji chụlaa ndị Naịjirịa na-ejịghị akwụkwọ ikike bata mba ahụ.,"Ọtụtụ ndị Naịjirịa si Amerịka piobanye Kanada Ọtụtụ ndị Naịjirịa si Amerịka bata Kanada mgbe Donald Trump batara obodo ahụ dịka onyeisiala. N'agbanyeghị na ọ bụghi naanị ndị Naịjirịa ka nchụla a metụtara, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ ga-aka metụta makana ndị Naịjirịa karịchara na ndị na-ejighị akwụkwọ nọrọ na Kanada. Onwereike bụrụ ntuliaka ndị Kanada na-achọ ime n'afọ 2019 kwanyere pati nọ n'ọchịchị n'ụdịrị omume a. Ọkaiwu isii gwara ụlo ntaakụkọ Reuters na ọ bu eziokwu na anya gọọmentị Kanada na-acha ọbara ọbara banyere etu ndị mmadụ si abata mba ha na-ejịghị akwụkwọ. Ha kwukwara na ọ bu ndị Naịjirịa na ndị mba Haiti ka ndị Kanada na-arọ anya. Kanada na-anabata ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ndụ Ụjọ na Trump ga-emezu nkwa o kwere ndị nkwado ya na ọ ga-etinye anya na ndị na-ejighi akwụkwọ nọrọ na Amerịka, so mee ka ndị mmadụ na-agbaga Kanada. Ihe karịrị mmadụ 36,000 nke ndi Naịjirịa so n'ime ya, si Amerịka gbaga Kanada maka ụjọ a. Trump n'onwe ya na-agba mbọ imezu nkwa o kwere. N'ime ụbọchị ole na ole gara aga, Trump kwuru na ọ ga-emegharị iwu nke kwuru na onye ọbụla amụrụ n'Amerịka bụ onye Amerịka. Ka Amerịka dịzị ọkụ, Kanada bụ agbatobi ha bụ ebe ndị mmadụ na-etinyezi anya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47295365,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47295365,Stray Bullet: Ugboro atọ mgbọ egbe tụrụ ndị Nollywood,Ọtụtụ oge ka a na-anụ na mgbọ egbe a gbara otu ebe gara ebe ọzọ gaa tụọ onye na-abụghị onye a chọrọ ịgba ya.,"Na Naịjirịa, ụfọdụ oge ka ọ na-abụ mgbọ egbe gbapụrụ n'egbe ndị ohi oge ha na-akwa mgbọ. Ụfọdụkwanụ, ọ na-esi n'egbe ndị nchekwa; ya bụ ndị agha na ndị uweojii. Ụdịrị ihe mberede a egbuola ọtụtụ ndị mmadụ, mana mmadụ ole ma na o metụtala ngalaba na-ahụ maka mmepụta ihe onyonyo na Naịjirịa bụ ""Nollywood""? Lee mmadụ atọ mgbọ egbe a na-akpọ ""stray bullet"" tụrụ na Nollywood: 1) Charles Okocha: Okocha e ji ""Igwe Tupac"" nakwa ""Amoshine"" mara maka ihe nkiri o merela, bụ otu onye ọnụ ya juru n'ekele maka ihe ọ gabigara. N'otu ụbọchị ọ na-agaghị echefu echefu n'ọnwa Disemba nke afọ 2015, mgbọ tụrụ nwa amadi a n'afọ, mana e mechara e wepụta ya; o nwerekwalanụ onwe ya. Site n'ihe o kọwara, mgbọ otu onye uweojii gbapụrụ ebe ha gara emume na Nnewi dị n'Anambara steeti, bịara tụ ya ebe ọ nọ ala na ya bụ emume. Okocha kwuru na e wepụtara mgbọ isii n'ime ahụ ya, ebe otu onye ọzọ mgbọ tụkwara n'otu emume ahụ nwụrụ. Tupu i lee ihe onyonyo a, mara na ihe ị ga-ahụ nwere ike ịgbakasị gị ahụ. 2) Henry Onyeka Nwankwo: Henry Nwankwo e ji 'Henry Kleinz' mara bụ onye na-eme ihe ntecha a na-akpọ ""make-up artist"" na bekee ma bụrụkwa onye na-eme ihe nkiri. Dịka o si kwuo, mgbọ tụrụ ya n'afọ 2017, na Jọs dị na Platu steeti, ka ọ na-ala n'ụlọ ịgwa nne na nna ya na ọ ga-aga mba ofesi ịga mahadum. Nwankwo kwuru na mgbọ onye agha gbapụrụ makana ọkwọụgbọala jụrụ ịkwụsị enye ha aka azụ, tụrụ ya n'otele, gafee ma gbawaa ya mgbawara azụ ya. Tupu i safeegharịa foto a, mara na ihe ị ga-ahụ nwere ike ịgbakasị gị ahụ. Nwankwọ ka na-azọ ndụ ya ruo ugbua makana ihe na-ebe ka na-ebe; ọnaghị aganwu ije na-enweghi enyemaka. 3) Clems Onyeka: Ọnwụ Clems Onyeka tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya, ọkachasị maka etu o si nwụọ oge ọ dị ka ọnwa ndụ ya achakewela. Dịka akụkọ si kwuo, mgbọ tụrụ Onyeka ka ndị ohi nọ na-ezu ohi n'ụgbọala na-ebu ego ndị ụlọakụ. Ha na ndị uweojii na-achụ ha nọ na-akwakọrịta mgbọ n'Asaba dị na Delta steeti, oge mgbọ tụrụ Onyeka si ebe ọ gara ime ihe onyonyo. Ọ nwụrụ ebe ahụ tupu e nwee ike ibuga ya ụlọọgwụ. Ihe a mere n'afọ 2014. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43858571,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43858571,Hollywood: Ndị Igbo nọ ebe ahụ,Igbo so n'otu ndị a kacha mara n'ụwa niile n'ihi na aga njem n'ebe niile ụwa sọtụrụ.,"Ụzọ Adụba so na ihe onyonyo 'Orange is the new Black' Ugbua anyi ga-etinye anya wee hụ ihe ndị Igbo wetara tinye n' ihe gbasara ihe onyonyo na egwu na Hollywood. Ha bụ ndị eji eme ọnụ na Hollywood Nonso Anozie, Ashley Madekwe na Chinwetel Ejiofor bụ mmadụ atọ na-eme ihe onyonyo na Hollywood. Ha emela ihe onyonyo ama a ma dịka ""12 Years a Slave"", ""Revenge"" na ""Game of Thrones"". Mmanwụ Mgbedike E gosiri ihu mmanwụ a kpọrọ 'Mgbedike' bụ njirimara Ndigbo. Ọ bụghị sọsọ Igbo na-ekpu mmanwụ mana e ji nke a mara anyị. Okpu mme Onye oti egwu Kendrick Lamar gosiri okpu mme bụ njiri mara ndị Igbo n'ihe onyonyo egwu ya bụ ""All the stars"" Aha na asụsụ ndị Igbo N'ihe onyonyo ""Black Panther"", Danai Gurira zara 'Okoye' bụ aha Igbo ebe Winston Duke mere ka M'baku sụrụ asụsụ yiri asụsụ Igbo 'Igbo Landing' Ụnụ ama na n'oge ndịọcha n'akpụrụ ndị isi ojii ndị Igbo dịka ndịohu, ọtụtụ ndị Igbo dagbunyere n'ime mmiri kama ha ga-ekwe bie ndụ ha dịka onye ohu? Ya ka bekee kpọrọ ""Igbo Landing"", eji ya ama atụ n'ụwa niile ma na a sọpụrụ ndị Igbo maka ụdị mmụọ ha nwere. Beyonce megharịrị ihe a n'ime onyonyo egwu ya bụ ""Love Drought"" nke pụtara n'afọ 2017." afirika-46938846,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46938846,Heart Surgery: E mere ya ụmụaka 24 na-akwụghị ụgwọ ọbụla n'UNTH Enugwu.,"Otu nne nwa si Port Harcourt bịa bụ Irene Uwandụ, kwuru na nwa ya Bethel Uwandụ nwere oghere n'obi nke ndị oyibo kpọrọ ""Hole in the Heart"".","'Nwa m anwụchala n'ihi ego adịghị ịwa ya obi' Uwandu kwuru na agwara ya weta ego karịrị nde naira ise n'India ka ewere waa nwa ya obi, mana ha enweghị ego ime nkea. O kwuputara ka aṅụrị sị ju ya obi na nwa ya adịrịla ya ndụ. Onye nne ọzọ awakwara nwa ya afọ na-akwụghị ụgwọ ọbụla bụ Esther Ejoh kwuru na nwa ya dị afọ iri na abụọ atala ha ahụhụ nke ukwuu nke na ha enweghịzị ego ọbụla ha ji eri nri. Nne nwatakịrị a gosipụtara obi ụtọ ya, Ejoh toro atụmatụ enyemaka nke UNTH Enugwu. Amah kwuru na ụmụaka na nne na nna ha akwụghị shịshị Onye isi Ụlọ Ọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Christopher Amah kọwara na ihe karịrị ụmụ aka iri na asaa bịara n'UNTH ịnweta ọgwụgwọ n'efu mana nanị iri na anọ ka ha mere. Amah yọrọ enyemaka gọmenti na ndị nwere ego n'Naịjrịa ka ha gbakwute ndị ogbenye ọsọ enyemaka site n'ịkwụrụ ha ụgwọ ma nyekwara UNTH Enugwu aka inwetakwu akatamkpọ akụrụngwa ejị awa obi. Amah kọwara na ọ bụ otu onye ụkọchukwu katọliki kpọtara ndị dọkinta niile sị aka bekee bịa waa ya bụ obi ebe otu nwoke sị Imo steeti kwụrụ ụgwọ ụlọ ọgwụ ụmụ aka ahụ niile nke mere ejịrị nye ha ọgwụgwọ n'efu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43329440,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43329440,'Anyị na-ejikọ aka maka mmepe obodo'-Gọvanọ South East,Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụ na ụba bụ Boniface Chizea ekwuola na irụ ụzọ njikọ n'ọwụwa anyanwụ bụ ihe kwesiri ekwesi,"Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu. O kwukwara na ọ bụ ihe akarị mego kamgbe,ekwesịghị ikuru ha aka maka nkpebi ọhurụ a. Nsogbu enwere bụrụ na mbụ bụ na-enweghị ụzọ dimma ejị aba gasi steetị ndị a. Chizea sị na ọ ga-enyere nzụkọrịta ahia n'etiti steeti ise dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ. ""Ọ ga-eweta nnukwu njikọ n'etiti ha."" Ihe bụkwa mkpa anyị bụ ma aga-emekwa ya bụ ihe ekwuru. O kwukwara na n'agbanyeghị na Gọvanọ na-achị Anambra steeti abiaghị ya bụ nzụkọ,na ọ nweghị ihe mebiri nụ. Ụfọdụ ọhọm Mazi Chizea na-ahụ na ya bụ nkpebi bụ ka aga-esi nweta ego wee ruọ ụzọ a makana steeti ọbụla nwere mkpa nke ha. O buru go dị na-eweta ego,ọ dikpa i mata ka-aga esi were ya ruọ ụzo maka mmefusi. Chizea kwukawara na ụgbua bụ oge iji nweta ihu onyeisiala bụ Buhari maka oge ntuliaka eruwe la makana o ga-ege ha nti. Na mbụ anyị gwara ụnụ na otu jịkọtara ndị gọvanọ ise dị na ọwụwa anyanwụ ekwuola na ha ga-amalite ozugbo ịrụ ụzọ ruru 430 kilo mitas ga-ejikota Enugwu, Anambra, Ebonyi, Abia na Imo steeti. Ndi Govano ise a bịakọrịtara n'Enugwu wee kwuo na ya bu okporo ụzọ ga-enyere aka ime njem site n'otu steeti baa n'ozo. Ndi otu ọrụ ụfọdụ bịakwara kọwara ndị gọvanọ a ihe di iche iche gbasara ọdịmma ndị zone ọwụwa-anyanwu a. Ha toro ụlọọrụ na-enye ọkụ bụ Aba Independent Power Project, wee gwa onye nwe ya bụ ọka mmụta Prof. Bart Nnaji ka odee ihe niile ọ gwara ha ka ha were ya nye ọchịchị onyeisiala bụ Buhari, iji hụ na ọkụ batara n'uju na mpaghara a. Ndị Gọvanọ bịara ya bụ ọgbako ha jịrị wepụta nkwekorita ha nile gunyere Ifeanyi Ugwuanyi - Enugwu; Okezie Ikpeazu - Abia; Dave Umahi nke Ebonyi bu Onye isi otu ahụ. Onye osote Gọvanọ Imo bụ Eze Madumere nọchitere anya Gọvanọ Rochas Okorocha, ebe Anambra abiaghị na ya bụ nzukọ otu ubọchi. Ndị Gọvanọ steeti ise ahụ nabatakwara atụmatụ ndị otu chọrọ igwu okwe lottery na southeast wetara wee kwuo na ha ga-eleba ya anya. Ndi Gọvanọ ọwụwa anyanwụ ala anyị ahụ kelere ndị niile bụ ndị Enugwu, Anambra, Ebonyi, Imo na Abia ka ha sị wee jikọta aka ọnụ nye Chief Alex Ekwueme ugwu ikpeazu n'oge olili ya, ha kwuru na ụdị agwa idinaotu a bụ ihe ga-enyere ndị steeti ise a aka. Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị:" egwuregwu-51691498,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51691498,Bournemouth vs Chelsea: Mmanya ngwọ ndị Chelsea agbọghị ụfụfụ na be Bournemouth,Dịka ndị otu Chlesea na-agba mbọ ihụ na ha sọ n'agba nke mbụ n'asọmpị Premiership ka ndị AFC Bournemouth chọrọ itinyere ha aja n'garri.,"Ndị otu Chelsea na AFC Bournemouth Ọ bụ na nkeji nke iri atọ na asaa ka Marcos Alonso nke Chelsea nyere goolu nke mbụ dịka ọ jiri shọtụ Giroud nke kụrụ n'baa were takaa netị ndị Bournemouth. Cheta na ọ bụ Alonso achụpụrụ mgbe ha na Bayern Munich zutere nsonso a nyere goolu a. N'agba nke abụọ ka Jefferson Lerma nke Bournemouth sahachịrị goolu ndị Chelsea. Ọ bụ kọna Fraser gbara ka Lerma jiri were isi mee Caballero ""ọ nọ nso eruaka"". Dịka ndị Bournemouth egbughị oge mgbe ha nyere goolu nke abụọ na nkeji iri anọ na isii. Ndị Chelsea chere na ọ bụ 'offiside' mana VAR siri na ọ bụ goolu. Chelsea gbalịrị ike ha nke mụtara mkpụrụ dịka Alonso gosi kwara na ọ bụ ọkaibe dịka o nyere goolu nke abụọ na nkeji iri asatọ na ise. Chelsea ka bụ kwa ndị agba nke anọ na tebulu ebe ndị Bournemouth nọ n'agba nke iri na asaa." afirika-49950409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950409,Catholic Bishops: Pope a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị?,Okwu gbasara ndị 'fada' ịlụ nwaanyị abụghị nke malitere taa mana e dịkwaka enwere ike isu ya kpọm taa.,"Ndị ụkọchukwu Katọlik kọrọ ụkọ n'ọtụtụ ebe na Amazon Ndị ụkọchukwu ụka Katọlịk si akụkụ mbaụwa niile ezukọla ka ha kpa ihe dị iche iche dịka mgbanwe eluigwe, mbịara mbịara, mana isi sekpụ ntị na ha niile bụ ma ụmụnwoke nụrụla nwaanyị a ga-bunwu ụkọchukwu. Otu ihe kwụpụtara n'akwụkwọ eji eme nzụkọ a bụ atụmaatụ nke gunyere ka ndị agadị nwoke lụgoro nwaanyị bi na Amazon na-echi ụkọchukwu. End of Twitter post, 1 Akwụkwọ a na-ekwukwa na agadị nwoke ndị a ga-abụrịrị ndị na-akwanyere onwe ha ugwu ma sikwa n'ebe ha chọrọ ịnọ rụọ ọrụ chukwu. Ndị Ụkọchukwu nọ na Saụtụ Amerịka tụtara alọ a ka e wee gbochie nsogbu ụkọ ndị ụkọchukwu n'ogbe ahụ. Nsogbu a butere na a naghị aka 'Masi' n'ọtụtụ ebe n'obodo ahụ. Ndị Bishop Katọlịk: Oke ogbugbu mmadụ ga-emebiri Buhari ntụliaka 2019 O nwere ihe dị njọ n'atụmaatụ? Ọtụtụ ndị na-ahụta ndị ụkọchukwu dịka ndị na-ekwesighị ịlụ nwaanyị dịka ọkwa ahụ si nye makana ọ bụ Chukwu na-alụ ya. Okammụta Linda Woodhead MBE kwuru na a na-enye ndị 'Fada' ihe ọbụla ha chọrọ dịka ego ụlọ na ego ha ga-eji na-egbo mkpa ka ha wee rụọ orụ ha ọfụma. ""Ndị mmadụ na-abịakụte 'Fada' dịka onye na-enweghị ihe ọbụla ha nwereike ịna-eze, ụkọchukwu ahụ ga-anatụ anya ha , nke a bụ ihe kachasị mkpa,"" n'okwu ọkammụta Woodhead. Ndị omenaala na-ekwu na ya bụ nzụkọ a na-enwe n'obodo Amazon nwereike ịla ụka n'iyi ebe ụfọdụ ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na amalite ya bụ atụmaatụ na ọ ga-emebisi alụghị nwaanyị ndị ụkọchukwu Katọlịk. Ha na-echekwa na enwereike ịtụta alo gbasara udiri echichi ụkọchukwu a gana-echi ụmụnwaanyị nke ga-eme ka malite chiwe ha ụkọchukwu. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mparịtaụka a @3Loretto kwuru na ọ gaghị ekwe ka atụmaatụ ọjọ a gaa n'ihu. @selicia_f kwenyere. @ThomasJTobin1 kwuru na o nweghị ihe ndị mmadụ ga-emeli maka ya bụ mkparịtaụka n'ọgbakọ ahụ kama ha kpe ekpere maka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị South -East Roads: Ndị njem atọla n'Ugwuoba n'ihi ọjọọ" afirika-49328871,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49328871,"Benin Market Fire: 'Ọkụ gbapịara ahịa mgbuka n'Uwelu, Benin metụtara ewu na ọkụkọ'","Mkpu akwa hịọrọ n'elu n'ala mgbe ọkụ gbapịara ụlọahịa mgbuka dị n'Uwelu Benin, Edo Steeti.","Akụkọ dị mkpa: Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ malịtere n'ime abalị nke mere na o nweghị ngwaahịa ndị mmadụ azọpụtanwuru. Otu onye na-azụ ahịa ebe ahụ aha ya bụ Joe gwara BBC Igbo na ọbụghị ahịa niile ka ọkụ ahụ gbara. Ụlọahịa mmadụ 68 lara n'iyi n'ahịa dị n'Obiagụ n'Enugwu Ọ kwuru sị: ""Ebe ọkụ a gbara bụ na A na kwa B 'line', ebe a na-ere akụrụngwa Mercedes, Mazda nakwa Ford'. ""Ihe ruru ọdụ ahịa iri atọ gbapịara n'ọkụ ahụ. ""O metụtara ọtụtụ ndị Bini, ndị Agbor nakwa ndị Igbo."" Joe kwukwara na osote onyeisi okpuruọchịchị ebe ahịa ahụ dị bịara n'ụtụtụ iji were ya hụ ebelebe gburunu. ""Mana ka ọ dị ugbua, onwebeghi ihe ọbụla anyị nụrụ n'ọnụ ndị gọọmentị. Police-tout class: Otu onye anwụọla, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ Ndị uweojii Nghotahie dapụtara n'etiti ndị agboro na ndị uweojii edulala otu onye mụọ, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ, dịka ndị uweojii Anambara steeti siri kwuo. N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed wepụtara ụbọchị Tuzde, o boro ebubo na ndị agboro chọrọ ịnapụ ndị uweojii bịara nnyocha maka ndị ojiegbeezu gbara ọsọ na-ezo n'ọdọụgbọala dị n'okporoụzọ Owere Road, dị n' Ọnịcha. Ọgbaghara nke butere kpachikpachi okporoụzọ mere ka otu onye uweojii gbaa egbe nke tụrụ otu onye. "" E bugara ya ụlọọgwụ a kpọrọ 'Toronto' ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla."" Mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ ma na-anata nleta n'ụlọ 'Multichoice dịkwa n'Ọnịcha. Joe Igbokwe e sorola n'ihe a na-eme Joe Igbokwe Nwa afọ Igbo bụ Joe Igbokwe ga-esonye na ndị ọnụ n'eru n'okwu na Legọs Steetị dịka aha ya so n'otu n'ime ndị kọmishọna iri na atọ nke Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu zịgara ụlọomeiwu steeti dịka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ. Tupu a họpụta ya dịka kọmịshọna, Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs nakwa onyeisi 'Wharf Landing Fees Collecting Authority'. Mana a matabeghi ngalaba gọọmentị bụ nke a ga-enye ya ka o lekọtawa. Nke a bụ nke abụọ onye Igbo na-arụ dịka kọmịshọna na Legos. Ben Akabueze rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna 'Economic Planning and Budget' agba abụọ bido n'afọ 2007 n'oge ọchịchị Babatunde Fashola dịka gọvanọ Legọs. Nwoke isi nkụka na Sydney Foto a gosiri ebe nwoke ahụ ji mma n'aka. N'ofesi, ndị uweojii nke mba Australia ekwuola na otu nwoke ji mma merụọ otu nwata nwanyị ahụ n'obodo Sydney nwetụrụ ọrịa isi. A na-arọkwa anya na ọbụ nwata nwoke ahụ sụgbukwara nwanyị ọzọ bụ onye e butere ozu ya n'okirikiri ahụ. Ọbụ ụmụokorobịa atọ aha ha bụ Lee Cuthbert, Paul O'Shaughnessy nakwa Luke O'Shaughnessy gbalịrị jituo nwoke ahụ tupu ndị ọrụ nchekwa abịaruo kpụrụ ya. Sneijder efeela aka Wesley Sneijder N'egwuregwu ọgbaa bọọlụ onye mba Netherlands aha ya bụ Wesley Sneijder awụsala ọwa. Sneijder gbara bọọlụ ihe ruru afo iri na asaa ma nwetakwa nturuugo di icheiche nke gunyere iko Champions league, Serie A nakwa Coppa Italia. Ọ gbara bọọlụ n'otu egwuregwu ndị dịka Ajax Amsterdam, Manchester United, Real Madrid, Inter Milan nakwa Galatasaray. Ọgwụ Ebola na-arụ ọrụ Ọrịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ 1,800 na mba DR Congo N'oge na-adịghị anya, ọrịa ebola nwereike inwe mgbochi na ọgwụgwọ dịka ọgwụ abụọ ndị e nyochara gosiri nke a. N'ime ọgwụ anọ e nyere ndị bu ọrịa na mba Congo DR ebe ọrị a na-akpa ike, abụọ n'ime ha kparaike n'ịgwọ ọrị a. Ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka ọgwụ mgbochi ọrịa so mee nyocha ahụ sị na mpụtara nke a bụ ""ezigbo akụkọ"" n'ibu agha megide ọrịa Ebola. Ọgwụ ndị a bụ REGN-EB3 na mAb114 na-eji akụrụngwa dị mmadụ na-ahụ ebuso ọrịa Ebola agha ma kpagbuo ike ya. Ha kpara ike ruru pasentị iri itoolu (90%) n'ịgwọ ọrịa Ebola na nyocha ahụ e mere. Ọ bụ unu ji gọọmentị akwụla ụgwọ opekatampe ọhụrụ Gọọmentị etiti ebola otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa ebubo na ọ bụ n'ihi oke ọchịchọ ha mere a malitabeghi kwụwa ha ụgwọ ọpekatampe puku naịra iri atọ. Onyeisioche ụlọorụ na-ahụ maka ụgwọ ọnwa bụ Richard Egbule rịọrọ ndị ọrụ ka ha biko wedata aka na gọọmentị agbalịala site na nkwenye ibuli ụgwọ ọnwa ha. Ndị Naịjirịa nwụrụ n'emume Hajj 2019 Ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa nwrụrụla ugbua na Saudi Arabia n'ihi emume Hajj nke 2019 e ruola itoolu. Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka Hajj bụ Ibrahim Kana gwara ndị ntaakụkọ nke a N'egwurgwu One na-agbara Naịjirịa bọọlụ bụ Henry Onyekuru ahapụla otu Everton nke mba Ịngland gawa mba Fransị ịgbara ndị Monaco bọọlụ N'aka ọzọ Michael Emenalo ahapụla ọrụ ya dịka onye ntuziaka egwuregwu bọọlụ na Monaco dịka ọ rụchara ọrụ afọ abụọ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47242611,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47242611,Nigeria Election 2019: PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ntuliaka adọtịrị,"Ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Najirịa bụ Inec adọtịala ụbọchị ekwesiri ịme ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke ndị ụlọomeiwu nakwa nke ndị ọkwa gọvanọ.","Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ha akwadoteghi ọ kachasị n'ikesa akaụrụngwaọrụ nakwa ịhazi ihe niile dị na ntuliaka kwesiri ịme taa. PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ndọtị aka ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Inec mere ntụliaka ọkwa Onyeisiala nakwa nke ndị omeiwu nke etiti na steeti dị iche ịchị. APC sị na ọ bụ nkata Inec na PDP kpara, ebe PDP gbụkwa otu asọ ahụ n'ọnụ. Festus Keyamo nke otu APC sị na ọ bụ makana PDP nọ n'ụzọ ịda na ntuliaka mere ha jiri mee ka Inec dọtịa emume a aka. Inec Anambra: Ndị Anambara atụla uche maka na Inec kwụ gidigbam Uche Secondus bụ onyeisi otu pati PDP kwuru dịka ọ bụ ya na Keyamo dekọtara akwụkwọ mgbasa ozi ebe ọ sịkwa na ọ bụ APC na Inec kụkọrọ mkpụrụ a furu ugbua. Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar tinyekwara ọnụ n'atụmatụ ndọtị aka a emere ntụliaka a. Atiku sị ndị na-akwado ya ka ha enwela iwe maka ihe mere. Ọ sikwa ha pụta n'uju bịa tụnye aka n'ụbọchị 23 nke Febrụwarị na ụbọchị 9 nke Maachị. Cheta na ọtụtụ mmadụ anọziela maka ntụliaka. Ụmụ Naịjirịa dị icheiche ebeela akwa arịrị gbasara ya bụ ndọtịaka Tosin Olugbenga na-akpọ NYSC oku ka ha tinye ọnụ n'okwu a Bashir Ahmad kwuru na ihe INEC mere adịghịrị ụmụ Naijirịa mma" afirika-45319239,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319239,Aka uweojii akaparala umụnwoke ndị ha sị na-eri onwe ha na Legọs,Aka akparala ndi uwejii sị bụ umunwoke na-eri onwe ha,"Iwu Naịjirịa anabataghị mmekọ nwoke na nwoke Aka akparala ụmụnwoke a sị na-eri ibe ha ebe ha na Legọs. Uweojii sị na ha gbakọrọ na-eme emụme iji nabata ndị ọhụrụ n'Egbeda, Legọs steeti n'ụbọchị ụka gara aga. Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ndị nche ogbe ahụ gbaara ha ama ebe ndị ụmụnwoke ahụ na-agba oringo n'ime abali. Ọ bụ onu Leah Sharibu nọ n'ekwe ntị N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 100 Nne na nna nwaada Leah Sharibu ekwuola na ọ bụ onu ya ka anụrụ n'igwe okwu ezigara ndị ntaakụkọ Cable. Nna Leah Sharibu gwara BBC na ọ bụ onu nwa ya, bụ otu onye fọrọ n'ime umụaka Dapchi nari na iri ndi omekome Boko Haram kpara aka n'afọ a. O kwuru na obi dị ha anụrị na nwa ha ka dị ndụ. Gụọ akuko a n'uju ebe Ọ bụ olu nwa anyị nọ n'igwe okwu - Ndị nwe Leah Sharibu. Ndị mmadụ kpụ Trump n'ọnụ Trump na McCain abughi ọyị mgbe McCain nọ ndụ N'Amerịka, akatọrọ onyeisiala ha bụ Donald Trump maka ọ chabịrị ugwu ruru Senatọ John McCain. Trump ewetụghị ọkọrọtọ Amerịka ruo mgbe okwesiri. Trump na McCain ejighi anya ahụ onwe ha mgbe nwoke ahụ dị ndụ. N'egwuruegwu, Sloane Stephens ewerela mmeri na malite US Open nke afọ a ebe o ji ọkpụ abụọ merie ogbo ya nke Russia bụ Eveniya Rodina. Serena bụ Ezenwaanyi na Tenis N'otu aka ahụ Ezenwaanyị Serena Williams merikwara Magda Linette bụ onye nke ya na ya kwatara. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia" afirika-52113070,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52113070,"Lee ebe ala, ụlọ ga-adịrị gị ọnụala na mpaghara ọwụwa anyanwụ","Oliver De Coque tiri egwu sị ""Olisa nyere onye ọbụla aka ka ọ rụọ ụlọ nke ya.""","Onye ọbụla zụtara ala ma rụtanwuo ụlọ nke aka ya mara na chi ya agbaarala ya ekeresimesi. Ala na ụlọ so na ihe e ji ekwu na akụ na-esi obi ike. Ma dịka mmepe na-abata na obodo dị icheiche n'ala Igbo, ịzụta ala adawala oke ọnụ. BBC Igbo kpọtụụrụ ndị ma anya ala bụ nke bekee kpọrọ 'land agents', iji mara ihe ala na-ada n'ahịa. Lee ebe dị icheiche aka nwere ike iru gi ịgbata ala N'Anambra Ọnịcha, Nnewi na Ọka bụ obodo kacha mepee emepe n'Anambra steeti. Ịgbata ala n'ebe ndị a abụghị ihe ụmụaka, mana i nwere ike zụta ala n'obodo ndị gbara obodo ndịa gburgburu. Na mpaghara 'Three-Three, Nkwerre Ezunaka, Nsugbe na Igbarịam, otu oke ala nwere ike ịbụ bido otu nde naịra ruo nde abụọ. Oke ala bụ nke bekee na-akpọ 'plot'. N'Ogbunike, ala kacha ọnụ ala ga-eru nde naịra abụọ maọbụ atọ. N'Ọba, otu oke ala dị n'ime obodo karịrị otu nde naịra na ọkara. Mana ala dị ebe mepere emepe ga-eru bido nde naịra atọ. Mpaghara Obosi (Awada na Ugwuagba), otu oke ala ga-akarị nde naịra ise, ma ọ bụrụ na ị hụ nke a na-ere ere. Agụ Ọka bụkwa mpaghara na-emepe emepe ugbua. I jiri nde naịra atọ na ụma, ị nwere ike ịhụ otu oke ala zụta. N'Enugwu Ebe na-emepe emepe na Enugwu ugbua bụ akụkụ ụfọdụ n'Emene nke dị n'obod Nike. Ebe ahụ ka mmadụ nwere ike ịzụta otu oke ala bido na otu nde naịra na ọkara ruo nde naịra atọ. Na Centinary City nke dị n'okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọtụ, mmadụ ga-azụtali ala bido na nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ. Mana ịchọọ ịga ebe ọkụ na-enwu n'elu dịka Independence Layout, jide nde naịra asato ruo nde naịra iri na abụọ n'aka. N'Imo Owere bụ obodo kacha mepee emepe n'Imo steeti, bụrụkwaebe mkpori ndụ na-ewu ewu. Ebe ala ka dị ọnụ ala ugbu a n'Owere bụ na mpaghara Obinze, Mgbirichi, Ụmụagwọ dịrị gawa. Ị ga-ahụkwa ala aka gị ga-eru na mpaghara Orji, Amakohia, Ogbaku, na Nekede. N'ebe ndị a, otu nde naịra ruo nde naịra atọ ga-azụtanwụ ala ga-aba ụlọ. Okigwe na Orlu bụ ebe ọzọ na-emepe emepe n'ihi ụlọakwụkwọ mahadum ụfọdụ dị ha nso. N'Abia Ịzụta ala bụ nnukwu ihe n'ala Igbo E nwere mpaghara Osisioma Ngwa ebe mmadụ ga-azụta ala bido nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ. Ebe ọzọ na-emepe emepe ugbua bụ mpaghara Ukwa. Ị ga-azụta ala nde naịra abụọ ebe ahụ. Mmadụ ga-ahụkwa ala n'Obi Ngwa. Ebe ndị a dị nso n'Aba nke bụ obodo ka mepee emepe n'Abia steeti. Umuahia bụ isi obodo Abia steeti dị nta karịa Aba. Ebe dịka Afara, Ubakala, Olokoro, Amakama, bụ ebe mmadụ nwere ike ịzụta otu oke ala bido na nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ. N'Ebonyi N'oge mbụ, a na-eche na Ebonyi emepeghi emepe. Taa, Abakiliki so n'otu obodo ka mepe emepe n'ala Igbo. Ịzụta ala n'etiti obodo Abakiliki abụghị ihe nta, mana na mpaghara Izzamgbo, mmadụ ga-ahụ ala bido na nde naịra abụọ gbagowe. 'New Layout', Azuiyiokwu, 'Mile fifty' sokwa n'ebe ndị mmadụ ga-ahụ ala ọ ga-azụ mana chetakwa na agbaghị aka enwude ọtaarụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe mere m ejighi akwado mgbachi ụlọ uka maka covid19 - Archbishop Chukwuma" afirika-43511905,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43511905,China na Amerika na-ama aka n'ihu,China kwuru na ha na-atule ibido nawa ego n'isi ngwa ahịa mba Amerịka ruru ijeri dọla atọ($3b) iji mekwara ụgwọ ọhụrụ nke onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump manyere na nwaga ahịa si China.,"Xi Jinping, onyeisiala China na Donald Trump, onyeisiala Amerịka Ngwa ahịa ndị China na-atule itinye ụtụisi na ha gụnyere anụezi, mmanya, mkpụrụosisi, ọpapa, na paịpụ na-anaghị ata nchara na ndị ọzọ. N'otu aka ahụ, China agwala Amerịka ka ọ gbara ihe ga-eme ka mekọrịta azụmaahịa dị na-etiti Amerịka na China 'gbajọ.' Beijing kwuru na ha na-ele anya na Amerịka ga-adụ azụ, ma ghara idu banye mba abụọ ahụ n'ọgụ azụmaahịa. Ndị China na-atụbata ezi na ihe ejiri anụ ya mepụta ebe ọ dị ukwuu Ụbọchị Tọọsde, Amerịka kwuru na ha ga-amanye ụtụ ruru ijerị dola iri isii($60bn) na ahịa e si China tụbata ma belata ihe China na-etinye na Amerịka. Nke a bụ iji kwụsị ozuzu n'ohi mmepụtachi nke China merela ọtụtụ afọ. Mana n'ụbọchị Fraide, mịnịstrị nke China na-ahụ maka azụmaahịa kwuru na mmekọrịta azụmaahịa bụ 'ihe ziri ezi ma jaa Amerịka ka ọ họrọ iji mkparịtaụka dozie okwu iji gbanarị ịmebi ihe. China kwuru na ha achọghị ọgụ azụmahịa mana egwu ọgụ anaghị atụ ha. Ụkwụ mbụ ha ga-atụpụ bụ ma ọ bụrụ na Amerịka jụụ inwe nkwekọrịta, ebe nke abụọ ga-abụ ma ha tulecha ụtụ Amerịka tụkwasara na ngwa ahịa e si China bubata Amerịka. Gịnị mere Amerịka jiri mee nke a Amerịka na-atụbata ahịa ijeri kwuru ijeri karịa China kwa afọ karịa ka ọ na-ebubata nke mere ka ha nwe imefu ihe dịka ijeri dola narị atọ, iri asaa na ise($375bn) afọ gara aga- nke mere ka Trump kwugide ya. China kwukwara na ha ga-agba Amerịka akwụkwọ n'otu azụmaahịa mba ụwa a kpọrọ, 'World Trade Association' na bekee, maka na Amerịka kwuru na ọnwa gara aga na ha ga-etinye ego ụtụ n'ahịa igwe stịl na alụminiọnụ. Egwu na-atụ ndị ahịa na China na Amerịka na-achọ ibido ọgụ ahịa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44721126,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44721126,"WAEC Results 2018: Mmadụ 786,016 gafere ule afọ a",Ụlọọrụ West African Examination Council (WAEC) ewpụtala mpụtara ule nke ndịukwu sekọndịrị afọ a bụ 2018.,"823, 424 ụmụnwoke na 748,972 ụmụnwaanyị dere ule a n'afọ 2018 Ulọọrụ ahụ kọwara na n'ime mmadụ otu nde na puku narị ise lere ule ahụ, mmadụ 786, 016 nke bụ pasentị 49.98 nwetara akwụkwọ ise ha gụnyere 'English na Mathematics'. N'ime ndị gafere n'ule a, mmadụ 389,655 bụ ụmụnwoke ebe mmadụ 396,361 bụ ụmụnwaanyị nke bụ pasentị 47.32 bụ nwoke ebe pasentị 52.92 bụ ụmụnwaanyị. Nke gosiri na ụmụnwaanyị ka ụmụnwoke gafee ule ahụ n'afọ a. Onyeisi ụlọọrụ ha Naịjirịa bụ Olu Adenipekun gwara ndị ntaakụkọ na ọnụọgụgụ ndị gafere ule a n'afọ a gbadara rue pasenti 10 ma i tulee ya na ndị gafere n'afọ 2017 ebe mmadụ 923,486 maọbụ (pasentị 59.22) gafere ya. N'okwu ya; ""N'ime mmadụ niile lere ule ahụ na Naịjirịa n'afọ a naanị mmadụ 1,470,338 ka anyị wepụtarala mpụtara ha ebe anyị ka na-eleba anya na nke mmadụ dị ọnụọgụgụ 102,058 maka ndehie dị icheiche ha mere oge ha na-edebanye aha. ""Waec na-emezi ndehie ndị ahụ ka anyị nwee ike iwepụta mpụtara ha."" Ndị niile dere ule ahụ na-ejighi Waec ụgwọ ọbụla nwere ike ịhụ mpụtara ha site n'ịga na webụsaịtị ha bụ www.waecdirect.org. Onyeisi ha kwukwara na asambodo mpụtara ndị ha wepụtarala ga-adị iwere na mkpụrụ ụbọchị 90. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46554515,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46554515,Brexit: Ihe ụmụ Igbo bi n'ofesi chere maka Theresa May,Ọ bụ n'ụlọomeiwu nke mba Briten a kpọrọ ka e mere ntụlịaka nke ga-egosi ma ha akwadoro ihe Theresa May na-eme maka Brexit.,"Ihe pụtara na ntụliaka ahụ bụ na ndị kwadoro Theresa May jiri vootu narị abụọ merie ndị akwadoghị ya nke mere na anapụghị ya ọrụ n'ike. May na onwe ya kwuru na mgbasa ozi ya na ọ ga-aga n'ihu ịhụ na mpụta mba Briten n'ọgbakọ Yurop bụ ihe ga-abịa na mmezu. BBC Igbo ajụọla ụfọdụ ndị Igbo bi n'ala ezenwaanyị Briten ihe bụ uche ha maka ya bụ okwu. Chuks Ukoh bụ onye na-ahụ maka ihe gbasara nchekwa kwuru na ọnwụ May na-esi maka Brexit bụ iji mezu nkwa buliri ya n'ọkwa ọchịchị. O kwukwara na mgba a a na-agba maka Brexit ga-emetụta ọtụtụ ihe n'obodo ahụ dịka akanaụba obodo na obibi ndị mmadụ. N'okwu ya ""okwu a ga-akpalite nsogbu dị n'etiti mba a na Northern Ireland na mbụ."" Nwa afọ ọzọ bụ Kelechi Isiodu bụ onye na-arụ ọrụ Injinia n'ofesi N'uche Kelechi, obi adịghị ya mma maka okwu Brexit a maka etu ihe ga-esi gbanwe. Oji ịzụta ihe dịka ọgwụ were maatụ. Ọ sị na ụfọdụ ihe ga-etinye ego n'ihi na ọ bụghị zi ndị agbataobi ha na EU ka ọ dị n'aka. Theresa May kwudosiri ike na ọ ga-mezu nkwa Brexit o kwere mana o kwukwara na ọ gaghị abụzi onye ndụ otu ya na ntụliaka ọzọ n'abịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" mba-uba-43442727,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43442727,Buhari ekelela Xi Jinping maka e megharịrị ya onyeisiala China,Onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Femi Adesina dere akwụkwọ ozi degara onyeisiala mba China bụ Xi Jingping taa maka na e megharịrị ya onyeisiala mba ahụ.,"Xi kwesiri iritu n'afọ 2023 mana nke agaghị emezi Adesina kwuru na Buhari jiri aka binye aka n'akwụkwọ ozi ekele ahụ o zigara Xi. O kwuru na Buhari toro onyeisiala mba China maka amamihe na ụdị ọdịnaihu o nwere maka China. Ụlọọrụ onyeisiala Buhari depụtakwara ozi ekele ahụ n'igwe mgbasa ozi Twitter taa. End of Twitter post, 1 N'akwụkwọ ozi ekele Buhari dere, o kwupụtara olileanya ya na Naịjiria na China ga-aga n'ihu na-enwe ezi mmekọrịta. Cheta na otu pati Communist nke Xi nọ na ya gbanwere iwu China iji mee Xi onyeisiala mba ahụ rue n'ọnwụ. Kemgbe 1990, iwu China kwuru na ọ bụ naanị ugbo abụọ ka onyeisiala China ga-anọ n'ọkwa. Mana Xi, bụ onye kwesiburu ịrịtụ n'afọ 2023, akpọpụtala onye ga-anọchị ya mgbe pati na-achị China nwere nnọkọ a n'ọnwa Ọktoba 2017. Iwu a emegharịrị ga-enye Xi Jinping ohere ịnọdu ka onyeisiala karịa ugboro abụọ o kwesịrị ịnọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49739186,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49739186,Port Harcourt Serial killings: Ụmụnwaanyị apụtala n'igwe na-eme ngagharịwe,Ndị uweojii nọ na PortHarcourt ekwuola na ha anwụchiela onye akọ n'ime ndị a na-eche na aka ha dị n'oke ogbugbu na-eme n'obodo ahụ.,"Ihe ndị uweojii chọpụtarala maka ụmụnwaanyị a tọgburu na Pọthakọt Onyeisi ndị uweojii bụ Mustapha Dandaura kwuru na ha nwụchiri nwoke ahụ n'ụzụ ụtụtụ Wenesde mgbe otu ụlọ oriri na nkwarị kpọkuru ha gbata ọsọ enyemaka. Dandaura kwuru na ụlọọriri na nkwarị kọrọ ha etu nwagbọghọ si tiwe mkpu n'ụlọ ndịna ha nke mere ka ha kpọwa ndị uweojii. Ndị uweojii ruru ebe ahụ gbawa ụzọ ma hụ nwagbọghọ ahụ na okorobia. Nke nwaanyị kwuru na ka ha na-arahụ ụra n'abali nke nwoke weter akwa eji ehicha ahụ wee chọọ ịtọgbu ya nke mere ka o tiwe mkpu. Egwu iwe ka ọtụtụ ụmụnwaanyị bi na Port Harcourt ji wee kele ụwa taa maka oke ogbugbu na-eme n'ụlọ nkwarị na oriri dị n'obodo ahụ. Ụmụnwaanyị a na-agagharị ime mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii, Department of State Services Government(DSS), nakwa ụlọomeiwu ka ha gwa ha ha teta n'ụra na agwọ nọ n'akịrịka kwesiri ka echekwa ndị mmadụ ọfụma. Ha chọkwara ka ha kwụsị ịkpọ ụmụnwaanyị nwụrụlanụ akwụna. Ngaghariwe a na-abịa dịka ndị uweojii nwụchirịla mmadụ abụọ a na-eche na aka ha dị na ya bụ oke ogbugbu. Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mustapha Dandaura gwara ndị ntaakụkọ na ụmụnwaanyị asatọ ka tọgbugoro n'ụlọ oriri na nkwarị dị iche iche na PortHarcourt. Dandaura kwuru na ha nwuchiri otu onye n'ime ndị a na-eche so akpa mkpa mkpa a ụbọchị Monde mgbe otu nwaagbọghọ gwara ha na mmadụ kpọrọ ya n'ekwenti ma kwe ya nkwa ego ruru puku iri atọ ka o dịna ya. Nke a mere ka ndị uweojii chọwa ya ma nwuchie ya. Ha nwuchiri onye nke abụọ ha nwetere na Kaduna steeti ma kwuo na ha ga-akpọghachi ya PortHarcourt ,ma che ha n'ihu ọha. Gee ihe Kọmịshọna ndị uweojii Rivas steeti kwuru maka ya n'uju n'elu: Akụkọ ndị ga-amasị gị" 55093124,https://www.bbc.com/igbo/55093124,'Okra' o nwere ike ibutere nwoke amụghị nwa? Lee ihe anyị chọpụtara,Ọkwụrụ so n'otu ihe oriri kacha edozi ahụ dịka nnyocha dị iche iche si gosi.,"Ọkwụrụ bụ otu n'ime ihe oriri kacha edozi ahụ Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwekwara ike ime nwoke agaghị enwe ike ịtụwa nwaanyị ime. Otu dọkịta a ma ama na soshal midia Naịjirịa bụ Nonso Egemba depụtara na websaịt ya na ọkwụrụ nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ, mana o nwekwara otu akụrụngwa nke bekee na-akpọ 'gossypol'. Egemba, onye e ji 'Aproko Doctor' mara na Twitter, kwuru na 'gossypol' a na-ebelata etu ughe (sperm) nwoke si arụ ọrụ. O kwukwara na ọkwụrụ adịghị mma maka onye nwere ọrịa 'anaemia', ndị na-eme egwuregwu (athletes), nakwa ụmụnwaanyị na-enwe nsogbu ịhụ nsọ ha. Lee ihe anyị chọpụtara Dịka Dọkịta Ugo Ezenyirioha si kọwaara anyị, ọ bụ eziokwu na ọkwụrụ nwere 'gossypol'. O kwukwara na 'gossypol' bụkwa ụdị ọgwụ ndị dọkịta na-enye nwoke iji gbochie ya ịtụwa nwaanyị ime. ""Iri ọkwụrụ ebe o buru ibu ruo ogologo oge nwere ike ime ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime n'ụwa ya (sterility)"". Osisi ọkwụrụ BBC kpọtụkwaara Oriaku Nwobi onye bụ ọkachamara n'iji nrị enye ọgwụgwụ, nke Bekee kpọrọ 'nutritionist'. O kwuru na ọrụ ọma ọkwụrụ na-arụ n'ahụ mmadụ buru ibu. Nwobi kwuru na ọkwụrụ magburu onwe ya maka ndị nwere ọrịa shuga (diabetes), nakwa ndị chọrọ ịta ahụ (weight loss). O kwuru na o dochaghị ya anya maka akụkọ na ọkwụrụ na-egbochi nwoke ịmụ nwa. ""Aga m enyocha nke a ma zighachitere gị ozi,"" Nwobi kwuru. Nchọpụta anyị mere gosiri na ọ bụ mgbe mmadụ na-eri ọkwụrụ ogologo oge, kwa mgbe kwa mgbe, ka o nwere ike ịmetụta ihe o ji amụ nwa, mana ọ bụghị oge niile ka nke a na-eme. Nnyocha ndị a abụghị ekwuchaa ọgwụ, maka na ụfọdụ ndị ọkachamara ka na-agbagha ya bụ okwu. Ihe ọkwụrụ na-enye n'ahụ N'agbanyeghi na ọkwụrụ nwere 'gossypol' dịka ụfọdụ ndị ọkachamara si kwuo, o nwekwara ọtụtụ ihe na-edozi ahụ. Ha gụnyere: Fibre, Magnesium, Vitamin A, Vitamin C, Folic acid (nke dị mma maka ụmụnwaanyị dị ime), Calcium (nke na-enye aka maka ọkpụkpụ), dịrị gawazie. Ọkwụrụ nwekwara nke Bekee kpọrọ 'Antioxidants' bụ nke na-enye aka egbochi ọrịa kansa, ọrịa shuga, ọrịa obi, nakwa mkpọnwụ ahụ (stroke). Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 43440308,https://www.bbc.com/igbo/43440308,Fada Patrick Edet bụbu ụkọchụkwụ Katolic agbala akwụkwọ,"Fada Edet onye nke gbara alukwaghịm n'ụka Katolik ọnwa itoolu gara aga, agbala akwụkwọ n' Uyo dị n'Akwa-Ibom steeti.","Fr Patrick Edet alụọla nwaanyị Fada Edet pụrụ n' ụka Katolik n'ọnwa Ọgọstu, afọ 2017 ma ga mepe ụlọụka nke ya nke ọ kpọrọ, Grace Family Assembly. Fada Edet, onye na-agbasa oziọma n' igwe okwu radio lụrụ Inyene Sampson Akpan, onye gụrụ akwụkwọ na mahadum Uyo a kpọrọ, University of Uyo na bekee. Ọnwa ole na ole gara aga, Fada Edet kwuru na ihe nkiri ọ wepụtara nke gbasara na ịntanet na ""O were m ọtụtụ afọ na ọnwa ịchọ, tupu m nwe mkpebi ịhapụ ihe gara aga, ma ga n'ihu na nnwereonwe iji imejupụta ihe a kpọrọ m"". Mgbe BBC kpọrọ ya na-ekwenti, ọ zaghị mana akụkọ gbasara agbamakwụkwọ ya n'Uyo buliere ndọrịtaụka na igwe okwu Sochal midia na-etiti ndị Katọlik na ndị ụka ọzọ maka iwu ụka Katolịc mabidoro ụkọchụkwụ ịlụ nwaanyị. Ebe ụfọdụ na-ekwu na ọdịghị mma, ụfọdụ na-ekwu na ọ kara ya mma ịpụ na Katọlik ga lụọ nwaanyị karịa ịbi ndụ njọ ịmetọ onwe ya. Adesola Aderele sịrị: ""Ịhapụ ịlụ nwaanyị n'ihi alaeze, dịka esi ekwu ya, nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ọsịere onye ahụ zuru oke ike ma nwoke ma nwaanyị. Ọkara mma ịlụ nwaanyị karịa na ahụ na-anọ gị ọkụ."" Chiagozie Chukwuka jụrụ: "" Ọ bụ na ọdighị mma na ọ gbara alụkwaghị kama ịnọ na-eme ihe nzuzo ekwesịghị?"" Ebe Justin Uzodimma kwuru: ""Ihe nke a dị egwu."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51516522,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51516522,Nwaagbọghọ o ji ntuliaka họta dị ya n'Ugwu Awụsa?,A na-akọ na ọgbara ọhụrụ batala n'omenala dịka tu nwaagbọghọ n'Ugwu Awụsa ejirila ntuliaka họrọ dị ga-alụ ya na Gaide dị na Bauchi steeti.,"Onye a sị meriri na ya bu ntuliaka na nwanne ya nwaanyị Akụkọ anyị nwetere bụ na otu nwaagbọghọ aha ya bụ Hajara nwere mmadụ abụọ na-abịara ya dị. Hajara gbara afọ iri na anọ (14) amaghị onye ọ ga-ahọrọ n'ime mmadụ abụọ a. Nke a mere ka ọ kpọkụọ ọhaobodo ka emere ya ntuliaka ga-enyere ya aka ịhọta dị ya. Ndị bịara ntuliaka alụmdi Hajara Eze obodo ahụ akpọrọ Giade bụ Mohammed Sabo Abdulkadir hiwere kọmiti ga-eme ya bụ ntuliaka nke Umar Saleh nọ n'isi ya. Ọtụtụ mmadụ pụtara ya bụ ntuliaka, ọkachasi ụmụnotorobịa nakwa ụmụaka. Ya bụ kọmiti mechere ya bụ ntuliaka nwoke aha ya bụ Yunusa merie. Mana onye nke abụọ aha ya bụ Ibrahim ekweteghị na mpụtara ya bụ ntuliaka maka ọ sị na ọ bụ n'ihu be Yunusa ka anọ mee ya, nke mere ọtụtụ ndị be ha jiri pụta n'igwe bịa tụọrọ ya vootu. Ibrahim were mkpesa gaa n'ihu eze Giade bụ Mohammed Sabo Adbulkadir. Eze obodo na ndị otu ya nọ ugbua elebe ya bụ okwu anya ịmata ka ha aga emegharị ya bụ ntuliaka. Mana ka ọ dị ugbua, nwanne nne Ibrahim ya na ya bi sị na ya akwadoghị Ibrahim na ya bụ ihe ọ na-eme maka na nke ahụ bụ mmechu ihu dịịrị ezinaụlọ ya. Ọ sị na Ibrahim bụ onye gbara afọ iri na asatọ (18) akana azụ nri etorubeghị ime ụdị ihe dị otu a na-agwaghị ha. Ọ sị na ya anọghị n'ụlọ mgbe ihe niile a na-eme. Na ya bata, na ya ga-atupuru Ibrahim ngwogwo ya ezi. Ihe nkiri a maka nwaanyị lụrụ di na nka ga-amasị gị: Ama m na chim ga-enye m di nke m - Nwaanyị lụru di na nka Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-49281299,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49281299,Transfer Deadline: Lee ndị a zụrụ na ego ole a zụrụ ha na EPL,N'elekere isii (elekere ise na England) nke mgbede taa bụ Tọọzde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst ka 'ọba ahịa' ndị otu egwuregwu bọọlụ nke England ga-apịachi.,"Ọba ahịa abụghị ahịa a na-ahụ anya kama ọ bụ oge e wepụtara ka ndị otu egwuregwu bọọlụ dị iche iche zụrụ ndị ga-agbara ha bọọlụ maọbụ ree ndị ha achọghịzi. BBC Igbo na-ewetara gị otu ihe si gbata kwụrụ ugbua n' egwuregwu, ""English Premier League"". Alex Iwobi Iwobi ga-ahapụ Arsenal gawa Everton. Nwaafọ Igbo a ga-ahapụ Arsenal gawa Everton dịka otu abụọ a kwekọritara ego dị nde paund iri anọ (£40 million). Everton bu ụzọ kweta ịkwụ nde paund iri atọ (£30 million) maka Iwobi, mana Arsenal jụrụ ajụ. Mana ha mechara kwelite ọnụ were zụrụ ya. N'aka nke ọzọ, ndị Arsenal zụtara otu nwata nwokorobịa aha ya bụ Kieran Tierney. Tierney onye mba Scotland gbabuuru ndị Celtic. Ọ gbara afọ iri abụọ na abụọ. Romelu Lukaku Nwaokorobịa a na-agbaburu otu egwu Manchester United ahapụla England gawa mba Italy ebe ọ ga-esonyere ndị otu egwu Inter Milan. Man Utd na Inter ekwekọrịtala ego dị nde paund iri asaa na anọ mana a na-ele anya na ego ahụ ga eru nde paund iri asatọ n'ọdịnihu. Lukaku erutelarị na Italy ebe a ga-enyocha ya ahụ tupu o binye aka n'akwụkwọ. Ọṅụ juputara ndị nkwado Inter Milan obi n'ihi ọbịbịa Lukaku. David Luiz na Laurient Koscielny Luiz ahapụla Chelsea, mana ọ gateghị aka n'ihi na Arsenal ebe ọ gara ka dịkwa na London bụ ebe Chelsea dị. Arsenal zụrụ Luiz iji nọchie anya Laurient Koscielny bụ onye gbara abụbụ hapụ ha gawa obodo ya bụ France wee sonyere ndị Bordeaux. Bordeaux kwụrụ Arsenal nde Euro ise iji zụrụ Koscielny, ebe Arsenal kwụrụ Chelsea nde paund asatọ maka Luiz. Paulo Dybala na Mario Mandzukic Akụkọ kọburu na ndị Manchester United nwere ike ịzụta Paulo Dybala maọbụ Mario Mandzukic iji nọchie anya Lukaku. Dybala na Mandzukic na-agbara otu egwu Juventus, mana ọdịghị ka okwu ha na Man Utd a ga-enwe isi. Ndị otu Tottenham tinyekwara anya maka Dybala mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Wilfried Zaha Wilfried Zaha Nwaokorobia Ivory Coast a etinyela akwụkwọ na-agwa ndị Crystal Palace na ya chọrọ isi n'otu ha pụọ. Agwa a Zaha kpara gbawara ndị Palace obi n'ihi na ọ bụ otu onye ha ji eme ọnụ. Arsenal na Everton egosila mmasị ịzụrụ Zaha mana amabeghi ka ọ ga-esi dị. Crystal Palace kwuru na ha agaghị ere Zaha ma ọ bụrụ na ha azụtaghị onye ga-anọchị ya. Marcos Rojo Rojo esozighị n'ihe a na-eme na Manchester United, mana Everton chọrọ ya. Mkparịtaụka ka na-aga n'ihu n'etiti otu egwuregwu abụọ a maka Rojo, mana oge adịghịzii. Akụkọ na-abịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" 43065408,https://www.bbc.com/igbo/43065408,Tsvangirai onye ndu na-ama Gọọmenti na-achị na mba Zimbabwe anwụọla,Onye ndu na-ama Gọọmenti na-achị na mba Zimbabwe anwụọla n'afọ 65 na mba South Africa dịka ndịisi pati ya kwuru.,"Morgan Tsvangirai gbasoro Robert Mugabe mgba dị ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke Zimbabwe Tsvangirai bụ onye bụ buru onye prịam mịnịsta nọ n'ute ọrịa Kansa; ""Ọ nwụrụ n'abalị a. Ezinụlọ ya gwara m"" osote onyeisi otu MDC bụ Elias Muduzuri gwara ndị Reuters. Oge ọrụ Tsvangirai jupụtara n'agha ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide onye bụ bụrụ onyeisi bụ Robert Mugabe. Akụrụ ya ihe ma tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ oge. Tsvangirai chọpụtara otu Movement for Democratic Change (MDC) n'afọ 2000 nke megidere ọchịchị Mugabe. N'afọ 2008 emere ntuliaka, Tsvangirai nwetara mbinyeaka karịchara n'agba nke mbụ mana o zughi inye ya mmeri. Tupu agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ ndị agha Mugabe busoro ndị otu Tsvangirai agha nke mere ka o wepụ aka ya n'ịzọ ọkwa ọchịchị ahụ, E kwupụtara Mugabe dịka onye mmeriri na ntuliaka ahụ mana mkpụ ndị mba ọzọ tiri mere e jiri kee ọkwa ọchịchị mee Tsvangirai Praịm minista. Tsvangirai zọrọ ọchịchị ọzọ megide Mugabe n'afọ 2013. Otu MDC e kewala maka onye ga-abụ onye ndụ ha n'ịzọ ọkwa ọchịchị nke na-abịa n'afọ a mmegide ndị Zanu-PF nke onye ndụ ha bụ Emmerson Mnagagwa." afirika-43780043,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43780043,Balarabe Musa: Sọ ndịohi ga-abụnwu onyeisiala Naịjirịa,Balarabe Musa kwuru na ọ bụ ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị butere ihe isi ike na agaghị n'ihu n'ala Naịjirịa n'ihi na pasentị iri itoolu na itoolu (99%) ndị nọ n'ọchịchị bụ ndịohi.,"Balarabe Musa Musa kwuru nke a n'ihe nkiri na-efegharị na Facebook nke gosiri ebe onye nwe ụlọọrụakụkọ SaharaReporters bụ Omoyele Sowore, chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala gara leta ya. O kwuru na ndị agba ọchie ndị ndu Naịjirịa wụrụ Naịjirịa n'ala. Musa sị: ""Kedụ ụdị ndị ndu Naịjirịa nwere? Ụdị ndị ndu Naịjirịa nwere bụ ndịohi. Kemgbe repọblik nke abụọ bịachara na njedebe, kedụ ka a ga-esi nwee ndị ọchịchị ndị abụghị ndịohi? ""N'ezie, e nwere ndị esoghị. Anaghị m ekwu na ọ bụ ndị ndu niile bụ ndịohi. Mba, e nwere ndị esoghị mana echeghị m na ndị aka ha dị ọcha ruru otu pasenti. Pasenti iri itoolu na itoolu bụ ndịohi. ""Iji maa atụ, kedụ ka ị ga-esi merie ma ị gbado ụkwụ n'iwu na omenaala Naịjirịa? Kedụ ka ị ga-esi bụrụ onyeisiala Naịjirịa na-ebughị ụzọ bụrụ onyeohi? N'ihi na ọ bụ site n'izu ohi ka ị ga-esi nweta ihe ị chọrọ. Ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime pati na ntuliaka na Naịjirịa bụ okwu eji ego ekwu. Ike ego na-enye sikwa na mmerụaka. Ya bụ ka o siri dị."" ""Anyị nwere nhazi ọnọdụ akụnaụba na ndọọndọrọ ọchịchị nke na-emetụta ka ihe niile si aga n'ala anyị. Ndị ndu nhazi a na-atụpụta bụ ndị ọdịmma onwe ha dị mkpa karịa nke ọha. Ebe ọ dị otu a, kedụ ka a ga-esi nwee ọganihu? ""E nyere m ọmụmatụ ọkwa onyeisiala, sị na onweghị onye ga-abụnwu onyeisiala ma ọ bụrụ na ọ bụghị onyeohi maọbụ nwee nkwado ndịohi. Nke a bụ eziokwu doro anya. ị ma na ịkwado ịzọ ọchịchị onyeisiala na Naịjirịa na-eri ijeri kwuru ijeri. Kedụ ka ị ga-esi nweta ijeri ndị a?"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46308885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46308885,Boko Haram: Ihe nkiri ọhụrụ egosila etu eji gbuo ndị agha Naịjirịa,Akụkọ ndị oyi egwu Islamic State (IS) zipuru ụbọchi Mọnde bụ ụbọchị 18 nke afọ kwuru na ha wakporo ndị agha Naịjirịa na Borno steeti wee gbuo mmadụ ọkankụ.,"Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ Ndị IS na otu n'ime oke abụọ Boko Haram na-aza otu aha. Otu a ha na IS kwụ bụ nke nwa onye hibere Boko Haram bụ Mohammed Yusuf nọ dịka onyeisi ha. Abubakar Shekau na-achị oke nke ọzọ. IS kwuru na ndị agha 40 nwụrụ n'aka ha na mwakpo a. Ihe nkiri a na-ekegharị na soshal midia na-egosi ihe yiri ndi agha Naịjirịa ka Boko Haram na-awakpo ha. Ihe a mere n'ọdọ ndị agha akpọrọ Metele di na Borno. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009 Ihe pụtara n'ihe nkiri a bụ ihe mgbawa obi. Akụkọ kwuru na onye ndu ọdọ ndị agha a nara mụọ n'ime mwakpo a. Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwubeghị okwu maka mwakpo a, ndị omeiwu Naịjirịa ekwuola na ha ga nyocha etu o siri mee. Na soshal midia, ụmụ Naịjirịa tinyere ọnụ na ọdachị a. Cheta Nwanze, bụ onye ọnụ ya na-eru n'okwu na soshal midia jụrụ ihe mere gọọmentị ejibeghị tinye ọnụ n'ihe mere, kama ha na-ekwu okwu maka ihe ndị ọzọ. Onye nwere akara Twitter @YarKafanchan jụrụ ihe mere ndị ntaakụkọ ekwughi maka ogbugbu a. @Omojuwa, bụkwa onye ọnụ ya na-eru n'okwu, dere na gọọmentị etiti dara ya mgbe ọ sị na ha emeriela Boko Haram ""technically"". Ndị na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru ụnyaahụ na ndị agha ga-ewepụte ozi maka ihe a mere mana onwebeghi ihe a nụru n'ọnụ ha. Otu Ihe nkiri ụfọdụ ndị agha si ebe ha sị bụ Metele ahụ sete gosiri ebe dị ka ebe ahụ Boko Haram wakporo. Ndị na-ekwu okwu n'ihe nkiri ahụ kwuru na ha enweghị ihe kwesiri nke mere Boko Haram ji na-awakpo ha n'ike. BBC Igbo gbara mbọ ka anụta n'ọnụ Texa Chukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa mana ekwenti ya agaghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45722121,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45722121,Lagos governorship Primaries: Ambode ekwetala na e meriri ya,Nke na-eme ugbua Gọvanọ na-achị Lagos steeti bụ Akinwunmi Ambode ejirila ugwu nara mmeri emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ APC mere na Lagọs ụbọchị October 2.,"Sanwo-Olu ga-azọ ọchịchị n'okpuru APC na ntuliaka 2019 O ziri ozi gwa ndị Legọs ha jisike kwado out APC n'udo na ntuliaka na-abịa. Kọmiti na-ahu maka ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs ekwuola na Babajide Sanwo-Olu bụ onye meriri ntuliaka imeụlọ nke APC na steeti ahụ. Onye kwuru ihe a bụ Clement Ebri, onyeisi kọmiti a. Ụnyaahụ, ka ndị na-akwado Babajide Sanwo-Olu na-aṅụrị maka mmeri ha che na o merịri na ntuliaka imeụlọ nke APC mere na Legọs, ndị pati ahụ hibere maka nhazi ntuliaka ahụ kwuru na ihe niile emere ụbọchị ahụ gara werewere. Mana, ka a na-eloda okpoko a n'akpịrị, onyeisioche pati ahu bụ Adams Oshiomhole gwara ndị ntaakụkọ na ntuliaka Legọs gara nke ọma, ma kwukwa na ihe niile dị n'aka ndị nhazị ntuliaka a Bekee kpọrọ Nationala Working Commitee (NWC) nke Clement Ebri no n'isi oche ha. Ka chi na-eji, onye bụ onyeisioche APC na Legọs bụ Tunde Balogun, kwuru na ntuliaka emere na Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu meriri. Cheta n'elekere asatọ n'ụtụtụ Oktoba 2, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara na wọdụ dị iche iche ebe a na-eme ntuliaka a. Ambode na Sanya-Olu bụ ndị na-azọ ọkwa n'APC Legọs Ndị ntaakụkọ BBC nọ na-ebe ahụ kwukwara na a hụrụ ebe ndị mmadụ na-ebinye aka n'akwụkwọ na ntuliaka imeụlọ a. Bola Tinubu bụ nna uku otu APC pụtakwara maka ntuliaka a, mana ndị kọmiti a na-ekwu na ihe a niile anaala n'iyi. Onyeisi kọmiti a akpọrọ Clement Ebri kwuru na, n'ime ọgbakọ ha nwere, ha kpebiri na o were ihe ha ga-agbanwe tupu ha bido ntuliaka a. Ndị mmadụ na-ekwu na ihe a were ike i bụ ihe mere gọvanọ Akinwunmi Ambode apụtaghị maka ntuliaka nke mere na Oktoba 2. Ambode apụtaghị Gọvanọ Legọs steeti bụ Akinwunmu Ambode abịaghị ebe ha na-eme ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs steeti. Oge o jiri nkeji atọ nwere gafere otu elekere nke ehihe (1:30pm) bụ oge a na-akwụsị ntuliaka imeụlọ APC na-steeti ahụ, o nweghị onye hụrụ Ambode na Wọdụ A5 na A6 ebe a na-atụ anya ya. Akinwunmi Ambode na Babajide Sanwo-Olu bụ ndị na-ọzọ ọkwa oche gọvanọ na Legọs bụ steeti dị ukwu na Naịjirịa. Kemgbe 1999, gọvanọ niile na-eji afọ asatọ achị Legọs mana ugbua were ike ime ya nke mbu, otu gọvanọ ga-eji sọọsọ afọ anọ were chịa Legọs steeti. Ọtụtụ ndị otu APC pụtara maka ntuliaka imeụlọ mere na Legọs Ọnọdụ pụtara maka akụkọ na-ekwu na Ambode na nna ukwu otu ndọrọndọrọ ahu bụ Asiwaji Bola Tinubu anaghị ahụ anya na anya. Ambode ka na-ekwu na onweghị eziokwu dị n'ime akukọ a. Mana ka o si dị ugbua, ndị omeiwu 36 n'ime 40 dị na steeti ahụ na-akwado Sanya-Olu. Onweghị onye maa ihe ga-eme Ambode ugbua." egwuregwu-43190137,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43190137,Carabao: Guardiola ebuliela iko ya nke mbụ n'England,Manchester City gbara Arsenal 3-0 iji bulie iko Carabao nke bụ iko mbụ onye nchịkọta ha bụ Pep Guardiola na-erite n'England.,"Nke abụ iko nke mbụ Guardiola na-ebute n'ime afọ abụọ o bidoro ịrụ ọrụ nchịkọta n'England Onye goolu Sergio Aguero, bu ụzọ nye goolu tupu Vincent Kompany agbazuo ya abụọ. David Silva gbazuru ya atọ, nke mere ka ọ bụrụ mmeri Arsenal karịchara nweta n'egwuregwu ngwụcha (cup final). Aguero nyechara goolu ugboro ise ikpeazụ ya na Arsenal zukọrọ n'asọmpi egwuregwu. Guardiola enwetala ihe nrite ""onye nchịkọta kacha mma"" nke ndị UEFA ugboro abụọ Iko Carabao a bụ nanị iko nkeụlọ Arsene Wenger bụ onye nchịkọta Arsenal na-ebutebeghị kamgbe afọ 21 o bidoro ịchị Arsenal. Mbuli iko a mere ka iko Guardiola butegoro n'ọrụ ya dị ka onye nchịkọta ruo 22. Ndị ọzọ bụ ndị o buliri oge ọ na-achịkọta Barcelona na Bayern Munich. Arsenal na Manchester City ga-ezukọ ọzọ n'ime izu a (ụbọchị Tọọsde bụ Maachị 1) ịsọmpi nke Premier League." afirika-50631290,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50631290,University of Transportation Daura: Ihe iri i kwesiri ịma maka Mahadum Njem a,N'ụbọchị Mọnde a ka Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-etinye ọkwụte a ga-eji malite ịrụ Mahadum Njem nke mbụ na Naịjirịa.,"Ndị gọọmentị na-azụ na Chaịna maka ụgbọ oloko Ọ bụ n'obodo Buhari bụ Daura ka a na-arụ Mahadum a. Ihe bụ ihe iri i kwesiri ịma maka mahadum a: Ogige njem so n'ime ihe gọọmentị Buhari tinyere uju na ya kemgbe ha malitere ọchịchị n'afọ 2015. Ha arụọla okporo ụgbọoloko nakwa ịrụcha ọdọụgbọelu ụfọdụ. Onyeisiala Buhari ebitela ọtụtụ ego n'aka mba Chaịna maka okwu ụgbọoloko. Maazị Amaechi sị na ọ bụ ịza aziza maka etu a ga-eji elekọta ụzọ oloko na ụgbooloko gọọmentị a rụrụ mere ya jiri wepụta atụmatụ mahadum. Maka ihibe mahadum a n'obodo onyeisiala, Amaechi sị na onweghi ihe nke ahụ pụtara maka Daura dị na Naịjirịa." afirika-44545092,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44545092,Mara ihe na-eme n'ikpe Shell na Eni bidoro ọzọ taa,Ikpe dị n'etiti ụlọọrụ abụọ na-arụpụta mmanụ agbịdị bụ SHELL na ENI na gọọmentị Naịjirịa ebidola ọzọ n'obodo Milan nke mba Itali,"Akụkọ na-akọwa na nke a nwere ike ịbụ ikpe mpụ na nrụrụaka dị n'etiti ndị mmanụ agbịdị a ga-akacha ekwu maka ya Tupu o bido taa, e bugharịrị ụbọchị mbido okwu ugboro abụọ; Maachị na Mee. E boro ndịọrụ ruru itoolu ndị SHELL na ENI ebubo na ha nyere aka azụ n'ọzụzụ onunu mmanụ agbịdị ha zụrụ n'afọ 2011. Ma n'ebo ahụ kwa onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Dan Etete na-aza ebubo na o ji aghụghọ mefuo ego kwesiri iru Naịjirịa aka. Mmadụ niile a kpọrọ aha n'okwu a na-agọ na ha emeghị ihe ọjọọ ọbụla. Lee ihe ndị dị mkpa ị kwesiri ịma maka okwu a: Mgbe o bidoro Onunu mmanụ dị n'elu mmiri na Pọtakọt Na afọ 2011, Shell na Eni kwuru ihe ruru otu ijeri dọla na ụma iji zụrụ onunu mmanụ agbịdị kachasị nnukwu na ọdịda anyanwụ Afrịka. Ha kwụnyere ego a n'akara ụlọakụ Naịjirịa n'obodo London mana o ruteghị Naịjirịa aka. Nyocha e mere chọpụtara na Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Dan Etete jịrị aghụghọ mefuo ego ahụ n'iji ụlọọrụ o nwere na nzuzo bu 'Malabu Oil & Gas' were ya bụ ego. Ndị a kpọrọ aha na ihe eboro ha Claudio Descalzi na ndị ọzọ gọrọ ebubo eboro ha. Onyeisia Eni bụ Claudio Descalzi, onye bụbu onyeisi Shell Marcus Brinded na mmadụ iri n'otu na ụlọọrụ abụọ bụ ndị a kpụpụrụ ụlọịkpe. Gọọmentị ala Naịjirịa na-ekpe ndị ọrụ Shell na Eni ruru itoolu na Etete bụbu Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị maka nrụrụaka, ịna aka azụ na igwu gọọmentị Naịjirịa chandum. Ndị a niile ekwuola na ha emeghị ihe ọjọọ ebe Shell na Eni kwuru na ha amaghị na ego ha kwuru agaghị erute gọọmentị Naịjirịa aka. Etu ihe si kwụrụ ugbua Obodo Milan dị na mba Italy bụ ebe ụlọịkpe na-enyocha akụkọ a dị Dịka e bugharịrị okwu a ugboro abụọ, taa bụ Juun 20 bụ mgbe ikpe bidoro n'ezie. Ụlọịkpe ahụ ga-enye kwa ndị ọzọ chọrọ isonye n'ikpe ohere ịbịa kwuo ihe a ga-eji nabata ha n'ime ikpe a." 44105473,https://www.bbc.com/igbo/44105473,Ihe ise ị maghị maka 'Yahoo-Yahoo',"O ruela abali atọ ""Yahoo"" ji na-ewu na soshal midia na Naijiria.","Ụfọdụ ndị otiegwu na-akwalite mpụ 'Yahoo-Yahoo' site n'egwu ha na agụ Dịka ndị EFCC wakpochara ụlọ oriri ma nwụchie ndị a na-eche na ha bụ ndị ji Yahoo-Yahoo aracha mmanụ, ọ bụrula isi okwu ndọrịtaụka n'etiti ndị na-eto eto na Naijiria. Ma lee ihe ise ị maghị maka ụzọ ụfọdụ ndị ọjọọ ji aracha mmanụ: 1.Kedu ebe aha 'Yahoo' ahụ si? Ndị ""Yahoo"" maọbụ 'Yahoo-Yahoo' bụ aha a na-akpọ ndị ji aghụghọ anata ndị mmadụ ego maọbụ ihe dị oke ọnụ site n'igwe okwu intanet. Ọtụtụ ndị okenye maara Yahoo dịka igwe okwu e ji ezirịta ozi nke ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Amerịka a kpọrọ, Stanford University bụ Jerry Yang na David Filo bidoro n'afọ 1995. Mana na Naijiria, ndị ọgba ọhụrụ ji aha ahụ mara ndị ji intanet anapụta ndị mmadụ ọkachasị ndị mba ofesi ego n'ihi na mpụ a bidoro site n'iji Yahoo ezirịta ozi. 2. Ị makwa na ọ bụ mba Amerịka bụ isi na mba ndị ji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego ha? Aha Naịjirịa na-ewu karịchaa mba ndị ọzọ n'ihe gbasara iji aghụghọ napụ mmadụ ego ya, mana ọ bụ mba Amerịka bụ ebe ndị omekome ji intanet akpa ike ka n'ọnụọgụgụ. Dịka ngụkọ e mere n'afọ 2006 siri kwuo, pasentị iri isii na otu (61), ndị omekome intanet si Amerịka, pasentị 16 si Briten, ebe pasentị 6 si Naijiria. Mba ndị ọzọ na-etinye aka n'ihe ọjọọ a gụnyere Saụt-Afrika, Togo, Aivrị Costu nakwa Nedaland. 3. O doro gị anya na akụkọ ngharamaụgha ha agbanwela? Na mbido, ndị omekeome na-ezipụ ozi site na 'Yahoomail' na igwe okwu intanet ndị ọzọ na-akọwara onye ha chọrọ ịghọgbu na ha bụ onye ọrụ gọọmentị nwere nnukwu ego ha chọrọ izupu ala bekee nke ha chọrọ enyemaka onye mba ofesi ma rịọ ka onye ahụ kwụta obere ego iji mee ka ọ gaa siriri werere. Ma ugbua, ọtụtụ ha na-esi n'igwe okwu ọgbakọ ebe ha na-egosi ọnwe ha dịka nwoke onye ala bekee chọrọ nwaanyị maọbụ nwaanyị chọrọ nwoke ya na ya ga-adị na mma. Dịka otu na-anata mkpesa maka iji aghụghọ napụ mmadụ ihe ya nke a kpọrọ, 'Internet Crime Complaint Center' siri kwuo, iji okwu ịhụnaanya were ghọgbuo mmadụ bụ mkpesa kachasị n'afọ 2014 dịka e nwere nsogbu metụtara nke a dị 5,883. 4. Ị mara ihe mere e ji akpọ 'Yahoo-Yahoo' 419? Ọtụtụ mmadụ na Naijiria mara na ihe a na-akpọkarị 'Yahoo-Yahoo'n'ala Naijiria bụ '419', mana ọtụtụ amaghị ebe akara ahụ si. ""419"" bụ ngụkọ njirimara akụkọ n'iwu Naijiria megidere mpụ iji aghụghọ nara mmadụ ego ya na ntaramahụhụ dịrị onye daara iwu ahụ. 5. Ị makwa na ndị otiegwu soro buru nsogbu Yahoo? Nsogbu a ebidoghị taa. Ọ rịrị elu n'oge ọchịchị Ibrahim Badamosi Babangida nke mere gọọmenti ji iwu pụrụ iche iji mabido mpụ a. Mana dịka ndị Igbo na-atụ n'ilu sị, 'arụ gbaa afọ ọ bụrụ omenaala', ndị otiegwu ụfọdụ jizi egwu ha na-eto mpụ napụrụ nwata ara nne ya n'ọnụ. Egwu dịka, 'Maga don pay' nke Kelly Hansome gụrụ, 'I go chop your dollar' Nkem Owoh, 'Yahoozee' nke Olu Maintain gụrụ bụcha egwu na-eto iji aghụghọ napụta ego. Ka ụfọdụ ndị egwu na-eto ime 'yahoo-Yahoo', ndị ogbo ha na-eto ndị na-eme ya. I gee egwu ụfọdụ ndị otiegwu ị maara na-etu aha n'egwu ha, ọtụtụ bụ ndị ebe ha siri kpata ego ha edoghị anya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48623404,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48623404,Rochas Okorocha: Aka Chibụrụ Imo steeti aṅụọla iyi ọrụ dịka Onyeomeiwu Naịjirịa,N'ụtụtụ taa bụ abali iri na ato nke ọnwa Juun 2019 onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan duru Okorocha n'iyi ọrụ mee ka o zuo oke dika onye omeiwu .,"Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec nyere Okorocha asambodo gosiri na ọ bu ya meriri ntuliaka eji họpụta onye ga-anọchịte anya mpaghara Imo West na Ụlọomeiwu Ukwu. Okorocha esoghi ndị omeiwu ibe ya ṅụọ iyi ọrụ n'abalị abụọ gara aga bu ụbọchi nke iri na otu nke ọnwa Mee n'ihi na mgbe ahụ INEC enyebeghi ya asambodo dika onye tuuru ugo na ntuliaka eme n'Imo West. INEC mechara nye Okorocha asambodo ahụ mgbe ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere ha iwu ka ha mee otu ahụ. Ọ fodụzịrị nani mpaghara Imo North ka ndị omeiwu ukwu si Steeti Imo zuo oke. Ntuliaka e mere iji họpụta onye ga-anọchi anya Imo North agachaghị nke oma, nke ahụ mere ka INEC yigharia ya bụ ntuliaka. Ma tupu eyighaa ya, Ndubueze Patrick, nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) ji vootu olemole akari nke onye ogbo ya bụ Benjamin Uwajumogu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC). Okorocha bụ aka chịbụrụ Imo steeti ka rituru n'ọkwa ọhụrụ a. Rochas Okorocha" afirika-46686695,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46686695,Boko Haram: Ndị uweojii anyị dị 2000 a na-eziga Ugwu zuru ezu,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Jimoh Moshood ekwuola na ndị uweojiii mmadụ 2000 ezipuru maka ị ga Ugwu Naijiria ebe ndị Boko-Haram na-akpa ike zuru ezu, na onweghị onye gbara ọsọ.","Akụkọ ụlọakụkọ 'Premium Times' wepụtara kwuru na""ndị uweojii dị 167 sọ na 2000 a họpụtara maka ọgụ megide Boko Haram n'Ugwu Awusa, agbaghala ọzụzụ ha."" bụ Ibrahim iIdris iji kwado mbọ a na-agba ịpịnyọ. Mana Moshood kwuru na akụkọ ahụ bụ ogbogbo ụgha. End of Twitter post, 1 ""Akụkọ ahụ nke kwuru na 167 n'ime ndị uweojii mmadụ 2000 nke onyeisi n ndị uweojii zipụrụ gbara ọsọ abụghị eziokwu, onye egela akụkọ ahụ. Akụkọ dị mkpa taa Anambra steeti emeriela n'asọmpị ndọrịtaụka 'President's School debate' nke emere n'Ọka. Godfrey Oluchukwu bụ onye nọchiri anya Anambra steeti gafere steeti itoolu iji meri ya bụ asọmpị gbadoro ukwu na afọ ri ise na asatọ najiria nwetara nwereonwe Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ bụ ndị si mba Ghana maka onye ọkwọụgbọala ha zuru ohi. Ndị Uweojii kwuru na ha ji 'acid' wakpo yabụ ọkwọụgbọala tupu ha zuo ya ohi n'Edo. Na mba ofesi Ala Afghanistan ejirila ọnwa atọ dọtịa ntuliaka ọkwa onyeisiala ha a na-akwado ịme n'ọnwa eprelu n'afọ 2019 Ha kwuru na ihe butere nke a bụ na ụfọdụ ndị chọrọ iso dọ ya bụ ndọrọndọrọ adibeghi njikere. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Fulham nakwa Wolverhamptons agbaala onwe ha onye laba onye laba dịka ha sọkọtara mpi ụbọchị Wernesde. N'otu aka ahụ Leicester City na Manchester city na-achịpụ ya ugbua. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 43692474,https://www.bbc.com/igbo/43692474,Ọrụ MMM ebiela site n'ọnwụ Mavrodi bụ onyeisi,Gịnị ka ndị tinyere ego ha n'ime ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM) ga-eme ugbua ha kwakọrọla lawa?,"Ndị isi na-akwado MMM depụtara akwụkwọ na ọrụ ha ebiela n'ebighebi maka ọnwụ onye bidoro ya bụ Sergei Mavrodi. Nkụchiobi gburu Mavrodi n'ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị 2018, nke mere ndị otu ya ji kwụsị ọrụ. Ka ọ nwụrụ, ndị mmadụ ezoghị ọnụ ha ka ha na-akwa akwa arịrị maka ego ha mefuru. Sergei Mavrodi ruru afọ 62 tupu ọ nwụọ Gịnị ga-eme ego ndị mmadụ? Mmechi MMM pụtara na ego ndị mmadụ efuola etu ahụ. Kedụ ka anyị si mara nke a? N'ime ndepụta ha tinyere na websaịt ha, ha kwuru na ndị mmadụ ma maka 'ọghọm' dị n'ime ya tupu ha ebido itinye ego ha. Ha kwukwara na ha dọrọ ndị mmadụ aka na ntị, gosi na o so n'ihe ndị ị ga-ebinye aka oge ị na-achọ idenye aha gị na websaịt ha tupu ibido inye ma nweta ego. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmechi MMM Ihe ndị MMM tinyere na websaịt ha na Ghana Ugbua Mavrodi nwụrụ, ndị mmadụ na-agba mbọ ichefu ego ha, n'agbanyeghị na ha nweburu ọbere olileanya na ego ha ga-emecha pụtara ha. Ụfọdụ bụ ndị na-achọghị imetara ndị ego ha furu ebere Ego m furu na MMM Ndị mere MMM na-eru uju na ha enweghizi olileanya maka ọnwụ Mavrodi" 42929960,https://www.bbc.com/igbo/42929960,"N'Italị, a nwụchiela onye gbara ndị mbịarambịara si Afrịka egbe","Ndị uwe ojii nke mba Italy anwụchiela otu nwoke a kpọrọ, Luca Traini, nke e chere na ọ bụ ya gbara ndị mbiarambiara ndị Afrịka egbe n'obodo Macerata, ụbọchị Satọde atọ nke ọnwa Febụwarị.","Luca Traini agbaghị nịkanịka ka a nwụchiri ya. Ndị ntaakụkọ kọwara na mmadụ isii merụrụ ahụ, ebe otu n'ime ha merụrụ ajọ ahụ. A gbara egbe na ọtụtụ ebe na Macerata A na eche na- agbamegbe ahụ metụtara ikpaoke agbụ n'ihi na a nwụchiburu otu nwafọ Naijiria maka ọnwụ 29-year-old Nigerian maka ọnwụ otu agbọghọ dị afọ ịrị na-asatọ akpọrọ Pamela Mastropietro n'otu ọbodo ahụ. Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kpọrọ ọkụ mmekwara ọnwụ ya na mgbasa ozi ntụliaka na abịa nso tupu mkpampka ahụ mere n'ụbọchị Satọde. Ndị uwe ọjii kwuru n' igwe okwu Twita sị: ""A gbara egbe na obodo Macerata. Ndị mmadụ merụrụ ahụ. Ndị uweojii na-eleba ya anya. Pụọ na ụzọ ma gbara ebe ọbụla sara mbara ọsọ."" Ha mechara kwuo n'aka akparala otu nwoke echere na ọ bụ ya gbara egbe ahụ onye ha nwetara egbe n'ụgbọala ya. Onye na-achị obodo ahụ gwakwara ndị madụ onye nọrọ be ya oge a na-agba egbe ahụ nke mere na ọtụtụ ebe na obodo ahụ. A kpara egbe na Via Spalato na Via dei Velini bụcha mpaghara obodo ahụ ebe a na-eme nyocha ogbugbu e gburu Pamela, onye a hụrụ ozu ya n'ime igbe akwa abụọ," afirika-43355717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43355717,UTME 2018: Ule Jamb ebidola na mpaghara Naịjirịa niile,Ule eji abanye ụlọakwụkwọ mahadum na Naịjirịa nke a na-akpọ Jamb n'aha ịchafụ bidoro na mpaghara Naịjirịa niile ụnyaahụ bụ abalị itoolu ọnwa Maachị afọ a bụ 2018.,"Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Ndị denyere aha maka n'ule a n'afọ a ruru mmadụ nde 1.6 gunyere mmadụ puku abụọ na-ede ya na Borno steeti bụ ebe ndị Boko Haram na-akpa mkpamkpa. Tupu ugbua, a na-eme ule Jamb sọsọ otu ụbọchị na na Naijiria niile. Ọtụtụ ndị dere ya bụ ule ụnyaahụ kwuru na nsogbu ha bụ na intanetị ebe ha nọ dee ya anaghị aga ọsịsọ kpatara na ha gburu oge maọbụ na ha edechaghị. Ugbua, igwe kọmputa ka e ji ede ule Jamb. Ọ bụghị akwụkwọ na mkpịsị ode eji edebu ya na mbụ. A ga-ede ule ahụ rue ụbọchị 17 ọnwa Maachị. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Jamb 2018 Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu etu ọ dị ha n'ahụ gbasara ule Jamb nke afọ a 2018 n'gwe okwu intanet. Benedict Okeke si Abia steeti ede akwụkwọ kwuru na Twitter na etu e si eme ya bụ ule na Abia steeti adịghị mma. Allem Muniat kwuru na e kweghị ka ụfọdụ banye n'ime ụlọ ebe a na-ele ule ahụ maka na ha yi akwa e ji mara ndị ụka alakụba. N'aka nke ọzọ, Michael Edene kwuru na ndị ọrụ Jamb anaghị ebido oge ha kwuru. N'okwu ya, ""Ndị mmadụ amaghị ejikwa oge na Naịjiria. Jamb kwuru na ha ga-ebido n'Elekere Itoolu mana ha ebidoghị rue Elekere 11 nke ụtụtụ."" Jamb bụ ule ụmụakwụkwọ si sekọndịrị na-ede tupu ha abanye ụlọakwụkwọ mahadum. Mana emecha ya, ụlọakwụkwọ mahadum ụfọdụ na-emekwa ule nke ha nke ha ji ahọrọ ndị ga-abanye ụlọakwụkwọ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43750158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750158,Champions League: Usoro eji ga-agba asọmpi,Usoro a ga-esi agba okara-ịkpeazụ asọmpị Champions League apụtaala.,"Liverpool jiri ọkpụ ise merie Man City Liverpool na Roma ga-asọ mpị n'ụbọchị 24 n'ime ọnwa Epureeli, ha ga-agba ụkwụ nke abụọ n'ụbọchị abụọ n'ime ọnwa Mee. Bayern Munich na Real Madrid ga-atụ aka n'ụbọchị 24 n'ime onwa Epureeli na ụbọchị otu n'ime onwe Mee. Ha ga-agba ngwụcha asọmpị a n'obodo Kiev n'ala Ukraine n'ụbọchị 26 n'ime ọnwa Mee. Liverpool bụ ndị mmeri Champions League n'afọ 2005. Ha na ndị Roma agbabeela bọọlụ ọbụla kamgbe ọnwa Maachị afọ 2002. Ronaldo bu onye nyere goolu gbafuru Juventus na-asọmpị a Bayern Munich ekwuola na Niko Kovac ga-abụ onye ga-anọchị Jupp Heynckes dịka onye nkuzi ha n'asọmpị a. Nke a ga-abụ ugboro abụọ Heynckes kuziri Bayern ka mgbe mmeri ha n'afọ 2013. Mana asọmpị ha na ndị Real Madrid ga-ekpo ọkụ makana Real bu ndị buru iko a n'afo garaaga. Real Madrid emeriela iko a ugboro atọ n'ime afọ anọ garaaga. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53833833,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53833833,Hope Uzodimma: 'Enwebeghi amụma Primate Ayodele buru n'isi ya mezurunu' - Emelumba,"Declan Emelumba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti, ekwuola sị ""nke a abụghị mbụ Primate Ayodele na-ebu amụma maka Gọvanọ Hope Uzodimma, mana enwebeghi nke mezurunu"".","Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị uche Chineke ga-eme oge ọbụla. Emelumba kwuru na ọ bụrụ na Ụlọikpe Ukwu mechaa kwuo na ha ga-elebanye ikpe ahụ anya ọzọ, na ha ga-adị njikere. Nke a na-abịa dịka Primate Elijah Ayodele bụ onyeisi ụlọụka INRI Evangelical Spiritual Church, buru amụma na ụlọikpe ga-enyochagharị ikpe Gọvanọ Hope Uzodimma. BBC Igbo kpọtụrụ Primate Ayodele dịka akụkọ na-efegharị na o kwuru na Ụlọikpe Ukwu nke Naịjirịa ga-achụpụ Uzodimma n'oche gọvanọ Imo steeti. Mana Primate Ayodele kwuru na enweghi ihe ọzọ o kwuru karịa na Ụlọikpe Ukwu n'oge na adịghị anya, ga enyocha ya bụ ikpe kpọbatara Uzodimma ọchịchị. O kwuru sị ka ""Uzodimma kee nkwụcha n'ihi na Ụlọikpe Ukwu ga-enyocha ikpe kpọbatara ya n'ọchịchị dịka Gọvanọ Imo steeti"". Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya na Uzodimma ekwubeghi okwu, na ọ hụtubeghikwa ya mbụ ma kwukwaa na ọ gatubeghi Imo steeti, nke pụtara na ọ bụghị mmegide ka ọ na-achọ imegide ya. Cheta na Fada Mbaka buru amụma na Uzodimma ga-enweta oche gọvanọ Imo steeti n'ọnwa Jenụwarị. Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma" afirika-47457775,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47457775,Tanka mmanụ agbịdị agbaala na Satellite Town dị na Lagos,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụgbọala tanka na-ebu mmadụ agbịdị, enwurula ọkụ na-agbasasị n'ogige Satellite Town.","Ọkụ nwuru n'ọwa mmiri mgbe mmanụ ụgbọala a malitere Ndị hụrụ ka ọkụ a na-agba, kwuru na mmanụ ụgbọala a malitere ịtapụ n'ala kemgbe ụtụtụ tupu ọ gbaa na mgbede a. Otu onye BBC kpọrọ n'ekwentị kwuru na ndị na-emenyụ ọkụ ọgbụgba a na-akpọ ""fire service"" na bekee, kwụbụ ebe ahụ kemgbe ụtụtụ na-eme ihe gbasara ọkụ a, mana ha anọghịzị ugbua. Etu ọ dị ugbua , ndị niile nọ n'ahịa ""Agric building material"" dị n'Abulado emechiela ahịa ma riwe mbo mbo ọsọ. Anya hụrụnụ kwuru na ọkụ gbapịara otu ụlọ ahịa nwafọ Igbo na-ere nkụ n'akụkụ ebe ihe a mere. Sochimaoge Madubo kwukwara na ndị ụlọọrụ mmenyu ọkụ ahụ wara ya bụ mmanụ ụgbọala na-atatu ụzọ na 'Canal'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46515420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46515420,EFCC: Ụmụ T.A. Orji ka anyị na-enyocha,Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade ewepụtala akwụkwọ ozi na-ekwu na ọbụghị na-ezie na ha na-achọ ụmụ Atiku Abubakar bụ onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala.,"Otu onye omeiwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ EFCC sị na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ha ajụjụ ịmata ma onwere ka ha sị jide ụmụ Atiku Abubakar ịchọ ma o nwere ego mba ofesi ha ji ike dị. N'okwu a, ""nke bụ akụkọ na egwu. Onweghi eziokwu tọgbọ n'ime ya"". Ha kwukwara na-ọtụtụ mmadụ amarala n'ụlọọrụ EFCC na-enyocha aka chiburu Abia Steeti bụ Theodore Orji bụ nke a na-ebo ebubo buuru ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naịra iri abụọ na asaa (N27b). Okwuru na, ""Ka anyị na-eme nnyocha a, anyị chọpụtara na ụfọdụ ego ndị ahụ sị ụmụ ya n'aka gafee"". EFCC na-enyocha ọtụtụ ihe ọdị ha ka ha eji ego ndị a zụta nke gụnyere ụgbọala. ""Fraịde gara aga anyị chụrụ otu n'ime ugboala ruo n'ụlọ oriri na nkwari dị n'Abuja"", dịka ha dere na-akwụkwọ a. Ha sị na ha mechere kpụrụ Ogbonna Orji gbara afọ 32 bụ onye bu ụgbọla Range Rover a na-ere otu nde narị naịra (N100 m) na ogbo ya bụ Kelvin Ilonah bụ onye bukwa ụgbọla Range Rover a na-ere nde iri atọ na ise (N35 m). Ka ha na-agba mmadụ abụọ a ajụjụ ọnụ ka ha kpọgara ha ebe ha bi bụ ebe ha na-akwụ ego dị nde naịra iri na atọ (N13 m) kwa afọ. Ha chọpụtakwara ụgbọla ọzọ bụ Prado Jeep 2017 bụ nke dị n'ebe ha. EFCC sị na mmadụ abụọ gbakwara ama nke na-enyere ha aka na nchọpụta ndị ọzọ. Akwụkwọ ahụ dere na, ""Ụmụ Atiku esoghị ndị ejidere"". Ndị ụlọọrụ ahụ jikwa ohere ahụ gọrọ aka ha n'ebubo eboro ha izu gara aga maka ịkpọchị ọbaego Peter Obi. Ha sịkwa na-eziokwu atọgbọghị na nka ma ọlị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50198706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50198706,AMAA 2019: Ọgọdọ ụmụnwaanyị sụ wuchie n'AMAA 2019,Ọ bụghị naanị akụkọ ndị meriri n'emume Africa Movie Academy Awards (AMAA) e mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọktoba pụtara.,"Ụmụnwaanyị bịara ya bụ emume sụụ ọgọdọ mere ka ndị mmadụ kpụrụ ha n'ọnụ ruo agwụ agwụ. Lekwa ụfọdụ n'ime ha na ọgọdọ ha sụ: Belinda Effah Ebe Belinda Effah bụ onye ihe nkiri ritere nturuugo AMAA n'afọ 2012 wuchiri n'emume ahụ n'uwe nke ya na-acha ọbara ọbara. Hilda Dokubo Uwe Hilda Dokubo suu bịa emume a mere ya ka ọ dịka nwa agbọghọ a ka na-achọ ịlụta ọhụrụ. Ihuoma Ejiofor-Suleiman Ihuoma Ejiofor onye ritere nturugo a n'afọ 2013 agbajọghị ndị nso nso ya agbanyeghị na ọ ka lụchara di nso nso a. Esther Agunbiade Esther nke Big Brother Naịja emepụrụ na nso nso a sụ uwe mere ka ndị mmadụ kpọwa ya ose na-acha anụnụ anụnụ. Sola Shobowale Lekwanu Sola Shobowale ka ọ dị ka nwa sisi a ka na-akpa nganga. Etu nwaanyị a si eme ihe nkiri nke ya na-enyekarị ndị mmadụ ọṅụ pụrụiche. O nwekwara ike ịbụ ya kpatara o ji nwete nturuugo ọkachaibe dịka onye nkiri mekarịchara ọfụma na ihe nkiri ""King of Boys"". Afọ 2019 ga-eme ya afọ iri na ise a na-eme ya bụ emume. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48797816,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48797816,Ghana vs Cameroon: Thomas Agyepong agaghị eso na asọmpi nke taa,Onyendu ndị otu egwu bọọlụ Black Stars nke Ghana bu Andre Ayew nakwa Thomas Agyepong esoghị na njikere ndị otu ha nwere iji kwadoo maka asọmpi ha na Cameroon taa.,"Ndị na-elekọta ha kọwara na ahụ esichaghị Agyepong ike iso gbaa asọmpị ha na Cameroon, ebe a na-ele anya na Dede Ayew nwere ike i so gbaa ya bụ asọmpi. Onye mgbasa ozi na ọnụ n'ekwuchitere ndi Black Stars bụ Dan Kwaku Yeboah kwuru sị na ""Ndị nlekọta ahụike otu Black starts si na ha ka na atule ahuisiike Dede nke ha ga-eji mara ma ọ ga eso na asọmpi nke taa."" Otu egwuregwu bọọlụ Ghana na-akwado asọmpị ha na Cameroon Ayew na Agyepong merụrụ ahụ na asọmpi izizi nke dị n'etiti Ghana na Benin Republic mgbe mba abụọ ahụ gbara onwe ha 2-2. Ihe onyonyo na-egosi na Andre Ayew nọ n'oche ka ndị otu ya na-eme njikere ụnyaahụ. N'aka nke ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ 'Indomitable Lions' nke Cameroun bụ ndị nke mbụ n'otu ""Group F"" dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Guinea Bissau na asọmpi izizi ha. Cameroun, bụ ndị buru iko AFCON n'afọ 2017, na-ele anya imeri Ghana taa iji wee gafee n'agba nke abụọ. Aka na-achịkọta otu egwu bọọlụ Cameroon, Clarence Seedorf Aka na-achịkọta otu egwu bọọlụ Cameroon bụ Clarence Seedorf kwuru na ha ga-agbali imeri Ghana ma gakwaa n'ihu buo iko AFCON ọzọ n'afọ a. Asọmpi Ghana na Cameroon ga-ebiri ọkụ n'elekere isii nke uhuruchi taa, Satọde abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun 2019. Otu egwuregwu bọọlụ Cameroon na-akwado asọmpị ha na Ghana Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54055804,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54055804,Ipob Oyigbo: Ihe m hụrụ maka mwakpo Oyigbo - Onye bi ebe ahụ,Otu onye bi n'Oyigbo dị na Rivers steeti ebe akụkọ pụtara na ndị oyiegwu ji ọgbatumtum bido gbawa egbe ma gbuo ụfọdụ ndị Hausa dịka ha wakporo ogbe ha.,"Ihe anyị ma maka ogbugbu ndị ugwu na Rivas Onye ahụ na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na etu o si mara na nsogbu dị n'Oyigbo bụ na mgbe ọ na-edupu mmadụ n'elekere ise nke ụtụtụ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị uweojii ka ha kwụcha na-echekwa ogbe ha. O kwuru na mgbe ọ jụrụ ajụjụ ihe na-emenụ, a gwara ya na o nwere ndị akpọrọ si ha na ha gaa wakpo ogbe ndị Hausa dị n'Oyigbo. Mana onyeisi okpuruọchịchị ahụ Gerald Oforji kwuru na ọ bụ nyocha ndị uweojii ga-enye ha ka ha ga-eji kọwanwụ ndị na etu mwakpo ahụ si gaa. O tiri ndị Hausa bi n'Oyigbo aka n'obi maka ihe mberede a dakwasiri ha ma na-ekwu na ha ga-agba mbọ hụ na ndị mere ihe a agaghị a na n'efu. O kwuru na ebe niile ajụọla oyi n'Oyigbo ugbua mana dịka onyeisi okpuruọchịchị ahụ, o kwụsitụla ndị ọgbatụmtum ị gba ma elekere asaa nke mgbede kụchaa. Ihe kọmịshọna mgbasaozi gọọmenti Rivers steeti kwuru maka mwakpo a Paulinus Nsirim bụ kọmịshọna mgbasaozi Rivers steeti kwukwara na ọ bụ mgbe ndị uweojii mechara nyocha ha ka ya ga-ekwu okwu gbasara mwakpo. Ọ bụghị Ipob wakporo ma gbuo ndị ugwu bi n'ogbe ahụ Ọkaiwu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Aloy Ejimako ekwuola na o nweghị mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo ka ndị Ipob gbuo onye ọbụla tụmadị ndị Hausa. O kwuru na ndị otu Ipob anaghị egbu ndị mmadụ makana ha na-akpọ ya ihe nsọ. Ejimako kwuru na ihe Kanu kwuru bụ ka ndị Ipob chekwa ndụ ha ma a bịa igbu ha. N'okwu ya, 'O nweghịkwa ndị Ipob na-egbu ndị Ugwu n'Oyigbo, ọ bụ mbochị ọnụ ka ha na-ebochi ha."" O kwuru na ihe abụ atụmaatụ a na-achị wepụta ka ndị ugwu wee gbuwe ndị Igbo bi na bee ha. Alloy kwuru na Kanu akpọghị ndị Fulani maọbụ ndị Hausa asị kama na ndị ọ na-ewesara iwe bụ ndị na-emegbu ndị Igbo. Ihe onyeisi ndị ugwu bị na Oyigbo gwara BBC Igbo Foto a na-egosi ụmụakwụkwụ almajiri azọpụtara n'otu ụlọakwụkwọ Alakụba dị na Kaduna steeti n'afọ 2019 Onyeisi ndị ugwu bi n'ọdịda anyanwu Naịjirịa nakwa Oyigbo bụ Musa Saidu ekwuola na ọ bụ okwu ndị otu Ipob batara ebe ndị Hausa bi n'Oyigbo gbuo mmadụ anọ. Mgbe anyị jụrụ ya, kedụ ka o si mata na ọ bụ ndị Indigenous People of Biafra gburu ndị bee ha, o kwuru si na mgbe Nnamdi Kanu kwuru na ha ga-emegwara ihe mere n'Emene, na ọ bụ ndị ugwu ka ọ na-agwa. Mana ndị uweojii na-ekwu na ha amaghị kpọmkwem ndị wakporo ogbe ndị awụsa ahụ. Saidu kwuru na ọ bụ kamgbe Buhari malitere ọchịchị n'afọ 2015 ka ndị otu Ipob bidoro wakpowe ndị bee ha bi n'Oyigbo ma na-ekwu na nke ga-eme ya ugboro ise ha na-awakpo ndị bee ha. N'okwu ya, ""mgbe ọ bụla ndị Ipob gagharịrị n'ogbe maka ncheta emume nwereonwe ha, ha ga-awakporiri ndị ugwu bi n'ogbe ahụ."" 'Mmadụ anọ nwụrụ na mwakpo Ipob mere ndị bee anyị n'Oyigbo' - Saidu Saidu kwuru na ụbọchị satọde bụ Sepụtemba 5 ka ndị Ipob wakporo ndị ugwu anọ na-azụ ahịa, gba ha egbe mana mmadụ abụọ n'ime ha nwụrụ ozugbo. O kwuru na ụnyahụ bụ ụbọchị Sọnde, Sepụtemba 6, na ndị otu Ipob bere ndị bee ise mma mana mmadụ abụọ nwụrụ nke mere ya ka ọ bụrụ mmadụ anọ nwụrụ na ngwụcha izuụka a. O kwuru na ọ gwala ndị ugwu bi ebe ahụ ha nọrọ jụụ makana ọ ma na ndị Igbo anaghị achọ okwu mana ọ maghị ihe mere ndị Ipob ji wakpo ha makana na ha achọ nwereoinwe ha. O kwuru na ọ bụrụ na nwakpo a gawa n'ihu na ọ gwala ndị bee ha ka megwara. 'A mabeghị maọbụ ndị Ipob wakporo ogbe ndị Hausa bi na Rivers state' - Ndị uweojii Omoni Nnamdi bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivers steeti ekwuola na ha na-enyocha ka ha mara ndị omekome gara gbuo ndị mmadụ n'ogbe ndị Hausa dị n'Oyigbo, Rivers State. Nke a na-abịa dịka asịrị na-efegharị n'elu n'ala, ọ kachasị na soshal midia, na ọ bụ ndị otu Ipob kpara arụ ahụ. O kwuru na ka ihe si kwụrụ ugbua, udo abiaghachila n'ogbe ahụ. O kwuru na ha anwụchiela ụfọdụ ndị a na-eche na ha kpara mkpamkpa ahụ ma zipukwa ụfọdụ ndị ọrụ ha ka ha chee ogbe ahụ nche. Ọ bụ ndị Ipob kpara mkpa mkpa a dịka e si ebo ha ebubo? Omoni kwuru na okwu ahụ esighị n'aka ndị uweojii kama na nnyocha ga-egosi ma ọ bụ ndị Ipob wakporo ogbe ahụ ma na-egbu ndị mmadụ ka ọbụghị ha. Mana ugbua ọ ka bụ kepukepu na ọ bụ ndị Ipob. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla ji aha Ipob na-akpa arụ nọ na nsogbu makana otu ahụ bụ otu iwu machiri. Kedụ ka o si mee? Omoni kwuru na ndị amaghị ndị ha bụ ji ọgba tum tum garuo obodo ahụ (Oyigbo) ebe ndị Hausa bi ma bido gbuwe ndị mmadụ n'ụtụtụ Sonde , ụbọchị isii nke ọnwa Sepụtemba. O kwuru na ha ka na-eme nyocha site enyemaka ndị isi obodo ahụ , onyeisi okpuruọchịchị ahụ nakwa ndị bi n'ogbe ahụ imata maka ihe mere ebe ahụ n'ezie ka ọ ghara ime ọzọ. N'uche ya , a na-eje n'ubi ọka a na-aka. Akukọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43861978,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43861978,Ihe atọ inwe ọtụtụ ọnụ mgbanwe ego na-ebute,"Iji mee ka mgbanwe ọnụ ego Naijiria kwụdosie ike, IMF adụọla Naijiria ọdụ ka o jikọta mgbanwe ego ya ọnụ.","EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị Naijiria nwere opeka mpe mgbanwe ego ise ; otu maka ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala na Najiria, otu maka ndị ụkaalabụkụba na-aga njem okwukwe na Saudi Arabia, otu maka ndị ụka Kraist na-aga ala nsọ, ọzọ maka ndị na-agụ akwụkwọ na mba ofesi na otu ọnụ nke gọọmenti hiwere. Dịka ndị ọkacharamara n'okwu akụnaụba bụ Pat Utomi na Uche Uwaleke siri kọwara onyentakụkọ BBC, inwe ọtụtụ mgbanwe ego nwere ọghọm. Lee ụfọdụ ọghọm inwe ọtụtụ mgbanwe ego: 1. Ọ na-ebute mmerụaka Pat Utomi kọwara na ọ na-eme "" Onye maa mmadụ enwe ohere igote ego n'ọnụala ma were ya tụọ mgbere, mana onye nwere mkpa ego ahụ iji tubata ihe ọ ga-eji mepụta ngwa ahịa n'ala anyị na amaghị mmadụ ọ gaghị eru ya aka. Ọdịghị mma maka ọganihu azụmahịa."" N'okwu ya, Uwaleke nyere ọmụmatụ sị, ""Dịka ọnụ ego mgbanwe nke gọọmenti bụ N305 , e resi mmadụ n'ọnụ ahụ, o nwere ike hapụ ihe a sịrị ya gote, resi ya onye ọzọ N365, nweta ọmụrụnwa.Mana ọ bụrụ na e nwere otu mgbanwe ego, ị gaghị enwe ike iregharị ya."" 2. Ọ na-emenyụ ọkụ itinye uchu na imepụta ihe n' obodo. Uwaleke sịrị na inwe mgbanwe ego dị ọtụtụ na-eme ọtụtụ ha dị uwengwụ. 'Sọọsọ ihe ha ga na-eme bụ ire ego dị ọnụala, agahị na-enwe mmepụta ihe.' 3. Ọ na eweda mmụbanye akụnaụba obodo Utomi kwuru na ""ọ bụrụ na ndị mmadụ na-enweta ego mgbanwe ego n'ọnụ ala iji ziga nwa ha obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ, ọ ga-eme ka onye ọbụla chọọ iziga nwa ya obodo oyibo, ụlọ akwụkwọ ndị dị n'obodo anyị ga akpụ afọ n'ala. Mana ha go ya n'ọnụ otu mgbanwe ego, ọ ga-eme ka ọtụtụ ego a na-etinye n'aguakwụkwọ na Naijiria jenite."" N'afọ ole na ole gara aga, Naijiria nwere nsogbu mgbanwe ego dịka akụnaụba ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi ọdịda ọnụ ahịa mmanụ agbidi n'ahịa mba ụwa. Ọ bụ ọnọdụ a mere na, dịka Uwaleke siri kwuo, ọ gaghị adabara Naijiria iso ndụmmọdụ IMF nyere. Uwaleke kwuru na ọ bụrụ na Naijiria nwe ya ugbua, na ọ ga arịa ya ahụ ịkwụ ụgwọ o ji na mba ofesi n'ihi n'ọ ga a dịrị ya oke ọnụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56496969,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56496969,Senator Abaribe and Orji Uzor Kalu: Gịnị ka ha ji agba onwe ha egbe ọnụ?,Mmadụ abụọ nwere agba n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'Abia Steetị bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-adụ onwe ha aka n'ọnụ.,"Esemokwu ha selitere isi elu ka a na-achọ ime ntuliaka onye ga-anọchiteanya mpaghara Aba North/South n'ụlọomeiwu nta dịka Ossy Prestige jibu ọkwa ahụ anwụọla. Mmadụ abụọ gbapụtara ihe n'ịzọ ọkwa ahụ bụ Mascot Uzor nke APC na Chimaobi Ebisike nke PDP na ntuliaka a ga-adị n'ụbọchị Satọde 27 Maachị. Kamgbe achụnta vootu malitere, sịnetọ Abaribe na Kalu na-akwarịta onwe ha egbe ọnụ dịka ha na-achọ ka onye ha na-akwado merie na ntuliaka. N'akwụkwọ Abaribe bipụtara o kpọrọ ""Made in Aba"", o kwuru na ihe mere e ji chutuo ya n'ọkwa osote Kalu mgbe ọ bụ gọvanọ Abia Steetị n'afọ 2003 bụ maka na ọ jụrụ ịgbara mma Kalu egusi. Ọ gara n'ihu kwuo na Kalu agbakebeghi site na mkpọrọ ọ gara n'ihi mpụ, tupu ọ bịa ị chụrụ nwanne ya Mascot Uzor Kalu nta vootu, na ọ maghị na ihe agbanweela n'Abia. Na nzaghachị, Kalu boro Abaribe ọtụtụ ebubo gụnyere na o nweghi ihe ọ rụrụ kamgbe afọ iri na isii ọ nọrọla n'ụlọomeiwu. Ọ gara n'ihu kwuo na Abaribe na-eri ego mgbazinye gọọmentị etiti ji enyere ndị mmadụ aka. Na gọọmentị nyere ego site n'aka ndị Sịnetị atọ na-achịteanya Abia Steetị n'ụlọomeiwu ukwu mana na o nweghi onye ọbụla sinetọ Abaribe nyere ego n'Abia South. BBC Igbo kpọtụrụ ndị Sịnetọ abụọ mana o nweghi onye n'ime ha kwuru okwu banyere ya. Orji Uzor Kalu zara ekwentị ya ma sị na o nweghi ohere ebe Abaribe azaghị ekwentị ya. BBC Igbo ga na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị sịnetọ abụọ, etu eke si anya anwụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44990606,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44990606,Boko Haram: Ndịagha Naịjirịa agbanwela onyeisi agha ọzọ,"Ndịgha Naịjirịa ahazigharịala ndịisi Lafiya Dole, bụ atụmatu ha ji ebuso Boko Haram agha.","Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Nke a bụ ugbo anọ e wepụrụ onyeisi Lafiya Dole n'ime ọnwa iri na anọ, nke ndị ma maka ya kwuru bụ maka mwakpo ndị Boko Haram wakporo ndịagha na nso nso a. Ike a ndị Boko Haram malitere na-akpa bu ihe nwereike imetụta Muhammadu Buhari na ntuliaka nke ga-eme n'ọnwa Febụwarị nke afọ na-abịa. Cheta na imeri Boko Haram so na nkwa Buhari kwere mgbe ọ na zụọ ọchịchị n'afọ 2015. Agha a na-ebuso Boko Haram abanyela afọ iri, mana nsogbu sitere n'ime ya pụta, ọkachasi nke metụtara ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa agha na-eme, adịghị ka ihe chọrọ ịkwụsị. Mana nhazigharị a, nke e mere Major General A.M. Dikko onyeisi Lafiya Dole, bụ nke ndịagha chere na ọ ga-eme ka olileanya onyeisi agha Naịjirịa bụ Lieutenant General Tukur Buratai bụru ihe a hụru n'anya. Akụkọ nhazigharị a pụtara n'ozi ndiagha Naịjirịa zipuru. Ha ekwụghị ihe mere Rogers Nicholas, bu onye ndụ Lafiya Dole kemgbe ọnwa Decemba nke afọ gara aga mana ndịagha a gbara ajụjụọnụ kwuru na obi adịghị Buratai mma maka mwakpo Boko Haram wakporo Borno na Yobe na mbido ọnwa. ""Na Yobe, otutu ndịagha anyị nwụrụ, otutu ngwa agha furu. Mwakpo a bu mkparị n'ebe onyeisi anyị nọ, ọ na-eche na ọ bụ mmeghe site n'aka nkwado anyị,"" ụfọdụ ndịagha kwuru. Gọọmentị Buharị nọ na-ekwu kemgbe Disemba 2015 na e meriela Boko Haram n'atụmatu Bekee kpọrọ 'technically'. Mana, mwakpo ebibeghị ka ndị oyi egwu a kpọrọ Islamic State of West Africa na Bekee ka ji ala na gbụrụgbụrụ Lake Chad. Ndị ochịehi na ndị ọrụ ụgbo na-enwe nnukwu esemookwu Na ebe ọzọ na Naịjirịa, mwakpo na-eme n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ụgbọ egbuola mmadụ karịa nke Boko Haram gburu n' afọ a, dịka otu International Crisis Group kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45410535,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45410535,MTN: Gịnị jikọrọ ha na ndị gọọmentị etiti?,Gọọmentị Naịjirịa adaala MTN nha ụtụisi ruru ijeri dọla abụọ nke kwaturu oke ha n'ahịa oke ụbọchị tusde.,"Ụlọ ọrụ MTN kwuru na ọkaiwu kachasị na Naịjirịa na-enyocha ihe gbasara ha ikwụ ụtụisi O tebeghi aka ụlọakụ ukwu nke Naijirịa nyere iwu ka ụlọọrụ MTN dị na Legọs weghachite ego ruru ijeri dọla asatọ ha bupuru n'ụzọ daara iwu. N'akwụkwọ ozi e depụtara iji kọwaa ihe gbasara ya bụ ego ụlọakụ ukwu kwuru na MTN ji asambodo na-akwụghị ọtọ wee zịga ego mba ofesi, MTN kwuru na ha na ndị ọkaiwu kachasị na Naijirịa na-eme nyocha ihe gbasara ịkwụ ụtụisi ụlọọrụ ha. MTN kwuru na ha akwụọla ihe ruru dọla nari asaa nke kpuchitere ụtụisi a na-ekwu maka ya. Akụkọ kwuru na kemgbe a machara MTN nha, oke wụturu ọfụma n'ahịa oke kemgbe ụtụtụ Tuusde. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47366378,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47366378,Presidential Election 2019: Ndigbo bi n’Okota na Oshodi chị obi ha n’aka,Udo alọghachịla n'Oshodi na Okota dika Ndịgbo bi n'Oshodi nakwa ndị na-azụ ahịa ebe ahụ pụtara gawa mkpa ha.,"N'ụzọ ụtụtụ Mọnde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị, ọgbaghara dapụtara n'Ahịa Oshodi dịka ndị agboro na ndị ntorobia ji mma na osisi wakpoo ma chụsasia Ndigbo na-ere ahịa. Oge BBC Igbo rutere n'ehihie Mọnde, ọtụtụ n'ime ha emepeela ahịa ha mana egwu ekweghi ụfọdụ mepee, ebe ụfọdụ na-arụzi ihe ndị e mebiri. Mana Eze Ndigbo Oshodi-Isolo bụ Reuben Ibeakama, kwuru na ya na ndị ndu obodo mpaghara ahụ akpaala udo makwa ndị ahịa ka ha gaa gbapee ahịa ha. Ọnụ na-ekwuru APC na Legọs bụ Joe Igbokwe kwuru na aka ndị ndu pati ahụ na Legọs adịghị n'ọgbaghara ahụ. Igbokwe sịrị n'aka ndị ndu APC adịghị n'ihe mere n'Oshodi -Joe Igbokwe ""O nweghị ezigbo mmadụ ga-asị ha ga-eme ihe a ha na-eme."" ""Ọ bụghị iwu na ị ga-atụ nyere otu pati. Ọ bụ ọchịchị onyekwuouche ya ka a noọ na ya."" N' Ọkọta, ọtụtụ ọdọahịa dị nso na Baba Ewe, ebe ndị agboro kpara ike ụbọchị ntuliaka agbapeghị n'ihi egwu. Udo alọghachiela n'Baba-Ewe Street, Ọkọta ebe ndị agboro kpara ike ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala(Febụwarị 23) mana egwu ka ji ndị bi ebe ahụ Ndị BBC gbara ajụjụ kwuru na egwu ka na- atụ ha dịka a mabeghị mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere. N'aka nke ọzọ, otu Massob akatọọla ike ndị agboro kpasoro Ndigbo na Legos. N'akwụkwọ ozi ha nyere ndị ntaakụkọ nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Samuel Edeson binyere aka, Massob kwuru na ọ bụ ihe mwute na a na-ebuso Ndigbo agha n'ihi ihe gbasara ndọrọndọ ọchịchị na agbanyeghị na oku otu Afenifere kpọrọ ndị Yoroba ka ha kwụsị ịlụso Ndigbo bị na Legọs ọgụ kwụsị. Akụkọ ga-amasị:" afirika-51838367,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51838367,Lamido Sanusi: Okwu isii na-akpọ ogwu n’ahụ sirila n’ọnụ ya pụta,"Dịka a chụturu Sanusi Lamido Sanusi n'oche Eze ka Emir nke Kano abalị ole na ole gara aga, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ okwu o kwuru bụ ihe butere ya nsogbu.","Maka ọ bụghị taa ka e jiri mara Awusa na ụta, Sanusi bụ onye e jiri okwu na-apụ ụka mara. Bido mgbe ọ bụ onyeisi ụlọakụ etiti (Central Bank) rue oge ọ banyere oche Eze, Sanusi Lamido Sanusi amaghị onye nwụrụ ụzụ akwa ya na-atu n'ikwu uche ya. Ọ bụ onye na-ekpu nkata n'ihu agwa eze okwu. Lee okwu azụ anụ ụka ndị o kwurula : 1. ""NNPC enweghị ike ịkọwa ebe ego $22Bn nọ"" Oge ọ bụ onyeisi ụlọakụ etiti (Central Bank), Sanusi kwuru ọtụtụ okwu na-ese okwu gụnyere ebubo na NNPC enweghị ike ịkọwali ebe ego dị ijeri dọla iri abụọ($20billion) ha retara na mmanụ agbịdị nọ. Gọọmenti etiti n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan kwere nkwa inyocha ebubo ahụ mana n'oge na-adịghị anya, ha napụrụ ya ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti. 2. ""Ndị nwe ụlọakụ na ndị ọgaranya na-ebi ego jịkọrọ aka na-akpagbu ndị ogbenye' Sanusi Lamido Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naijiria N'afọ 2010 oge ọ na-ebu agha megide nrụrụaka n' ụlọakụ dịga na Naijiria, Sanusi nọ n'emume Mahadum Bayero University Kano sị na o zuorola ndị nwe ụlọakụ nakwa ndị ọgaranya ha na-agbazinye ego. N'akụkọ nke 'Daily Trust' wepụtara, Sanụsị kwuru sị,""Ndị nwe ụlọakụ nakwa ndị ọgaranya na-ebi ego nakwa ndị nọ n'ọkwa ọchịchị bụ otu ndị n'azọ ndị ogbenye ụkwụ nisi . Ya mere anyị ji sị ugbua, o zuola bụ na o zuola."" 3. 'E kee ego ndị ụlọomeiwu ọkara, a ga-eji ya nye ọtụtụ ụmụ Naijiria ọrụ' ""Ebe ka 'mgbanwe(change) nwa dị? 'Change' kwesịrị ibido n'ụlọomeiwu"". Onye sinetọ na-eri nde naira iri atọ na isii (N36 million) kwa ọnwa. I kee ya abụọ, ọ bụụ nde naira iri na asatọ. Nde naira iri na asatọ fọrọ nwere ike inyenwu ụmụ Nairia 2000 ọrụ. ha ga-na-eri puku nairi naira itoolu kwa ọnwa."" ""I were mmadụ iri nari (200) mụbaa ndị Senetọ 109, nke a ga-enye ụmụ Naijiria 21,800 ezigbo ọrụ."" Onye ụlọomeiwu nta na eri nde 25 n'ụgwọnwa. ""Ọkara ego a bụ nde naira iri abụọ na ụma ise (N12.5 million) nke a zuru iwe ụmụ Naijiria 135 n'ọrụ a na-akwụ ha puku naira iri itolu narri naira abụọ, nari naira ise."" ""Naijiria nwere ndị omeiwu 360 n'ụlọomeiwu nta. Okara ụgwọonwa ha ga-enye ụmụ Naijiria 48,600 ezigbo ụgwọọnwa."" 4. 'Ndị Ugwu akwụsịghị ịlụ ọtụtụ nwaanyị, ịmụ oke ụmụ, ha ga-anọgide n'ụbịam' Sanụsị nọrọ n'ọnwa Janụwarị afọ 2020 oge ọ gara emume maka ụmụakwụkwọ gụchara mahadum nke 'Federal University' Gusau kwuo sị na ọ bụrụ na ndị ugwu agbanweghị na ụbịam na agaghị n'ihu ga abụ nketa ha. Ọ sị: ""Ụbịam n' Ugwu dị pasent 80; ebe ọ bụ pasent 20 na ndịda n'ihi omenala ịlụ ọtụtụ nwaanyị na ịmụ ụmụ a ga-agbahapụ ha na-arịọ arịriọ n'okporoụzọ."" ""Nsogbu ndị anyị nwere taa dịka ịṅwụ ọgwụ ike,Boko Haram, oke ohi, na enweghị ọrụ ga-abụ obere ya n'afọ 20 maọbụ 30 na-abịanụ."" 5. 'Na nwa m nwaanyị mara nwata nwoke ụra gosiri na nwoke agaghị emegbu ya, ọ gba nkịtị' Sanusi kọrọ akụkọ etu nwa ya nwaanyị bụ Shaheeda Sanusi siri maa nwata akwụkwọ nwoke ogbo ya ụra maka ịkparị ya were sị nwa ya agaghị edinwu nwoke ịkparị ya. Ọ gbara ndị sị na ya na-enye nsogbu ha chee aka ghọrọ agbụrụ Sanụsị na-abịa. 6. 'Ọ bụrụ na ndị Ugwu agbanweghị, 'quota system' ga-ememila ha' Na mmeme ncheta afọ iri isii nke Nasir El-Rufai na Kaduna n'afọ a, Sanusi kwuru sị sị,""Anyị na-ekwu ya kemgbe afọ 20 maọbụ 30. ọ bụụ na ndị Ugwu agbanweghị, ha ga-ememila onwe ha."" ""Ala Naijiria na-aga n'ihu. Okwu 'quota system' onye ọbụla na-ekwu nwere mgbe ọ ga-erue, chi ya ejie."" Ọ dọrọ ndị ntọrọbịa Ugwu aka na ntị ka ha tinye uchu n'akwụkwọ n'ihi na oge na-abịa oge a ga-agbanwe iwu Naijiria nke na ebe i si maọbụ okpukperechi gị agaghị enye gị ọrụ. 7. 'Ihe ụfọdụ ndị gọvanọ na-ejeta na Chaina bụ mbibi ego' ""Anyị nwere ndị na-aga njem Chaịnaotu ọnwa, ihe ha ji alọta bụ akwụkwọ nkwekọrịta mbibi ego."" ""Chaina binye gị ijeri dọla iri na asatọ($18) iji rụọ okporo ụgbọoloko, ha ga-enye gị okporo oloko, nye gị ụgbọoloko, nye gị onye ọgbọụgbọ, kedụ zie uru iritere na mbibi ahụ?"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48961686,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48961686,Nigerian music: Ihe mere o ji dị ka ndị Igbo na-ala azụ n'egwu - Ruffcoin Nwa Aba,Nwa afọ Igbo a ma ama na-eti egwu aha ya bụ Ruffcoin Nwa Aba tinyere ọnụ n'okwu banyere ndị kachasị ewu ewu na Naịjirịa.,"Content is not available End of Facebook post, 1 Ọ gwara BBC Igbo na ndị mpaghara Ọdịda-Anyanwụ kachasị ewu makana ọ bụ n'aka ha ka ihe mgbasaozi kacha dị na Naịjirịa. O kwuru sị, ""Ọ bụ ha kacha nwee ụlọọrụ mgbasaozi, nke mere o ji na-enye ndị be ha ohere iwepụta egwu ha ka ndị mmadụ mara na ha ka nọkwa ya."" Ọ gara n'ihu sị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ kwesịrị itinye uche mee ka ha gbagote n'ọkwa. Nwaamadị a gakwara n'ihu dụọ ndị ntoroọbịa ọdụ ka onye ọbụla jisi ike n'ihe ọbụla ọ na-eme. Ruff Coin Nwa Aba kụrụ egwu mbụ ya n'afọ 2002 mana egwu buputara ya bụ nke a kpọrọ ""Nwa Aba"" nke ọ kụrụ n'afọ 2007 Nwa Aba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo nwere n'ihe omume a kpọrọ ""Gịnị na-afịọ?"". Ọ kọwara na ọ bụghị taa ka o bidoro kụwa egwu, mana ọ bụ n'afọ 2007 ka ọ chakere n'ihi na ọ daghị mba n'ọrụ. N'ọnụ ya, ""Ihe ọbụla onye na-eme, ya mepagide ya, otu ubọchị ọ ga-akwụta ụgwọ. ""Ọbụladị mmiri na-atụ pem pem, ọ ga-atụgide otu ahụ tụpuo ala kọnkịrị"". Maka Biafra: Nwa Aba kwuru na Biafra ga-amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na enweta ya n'udo. Mana ọ gaghị abụ ihe ọgụ na mgba. O kwuru sị, ""Biafra bụ ihe ziri ezi. Anyị nweta Biafra ọ ga-adị mma, mana ọ bụ usoro e ji agbaso ya ka a ga-eleba anya. ""A ga-achọ etu ndị okenye ga-esi nọrọ ala kpaa ya iji nweta ya n'ụdị udo"". Lee ihe nkiri ga-amasị gị: Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45969275,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45969275,Wizkid Fever: Wizkid ọ bụ iko Tiwa?,"Ihe onyonyo egwu ọhụrụ a kpọrọ ""Fever"" nke otiegwu a ma ama bụ Wizkid gụrụ pụtara ụnyaahụ ebutela oke arụmụka n'etiti ndị mmadụ.","Ihe onyonyo egwu a gosiri ebe Wizkid na Tiwa Savage na-afịa onwe ha aka n'ụzọ mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Nke mere Twitter jiri nwuru ọkụ ebe ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ dịka ""ha abụọ ọ bụ iko ibe ha?"" nakwa ajụjụ ndị ọzọ. Quillon Mazi Nze kwuru na mmekọrịta wizkid na Tiwa abaala ogogo ọzọ. End of Twitter post, 1 Ụfọdụ ndị na-akatọ ụdị ọnọdụ a hụtara ha n'ihe onyonyo ahụ karịsịa n'ebe Tiwa Savage nọ dịka ọ bụ onye lụrụla di. Mike Erezzy sị na ọ bụ ihe ụjọ nye ya na Wizkid ji hụ kpọrọ nkụ akwaso Tiwa Savage iko. Ebe ndị ọzọ dịka Uchayy na-ekwu na ọ bụ ụdị mmekọrịta a dị n'etiti Wizkid na Tiwa bụ nke ọ chọrọ. Cheta na nke a abụghị nke mbụ a na-ahụta ha n'ụdị ọnọdụ a bụ nke ha pụtara na Twitter gọọ na ha abụghị iko. Tiwa Savage lụrụ Tunji Balogun ""Tee Billz"" n'afọ 2013 ma mụtara ya otu nwa nwoke mana ha nwere nsogbu n'ezinaụlọ ha. Ebe Wizkid nwere ụmụ atọ site n'aka ụmụnwaanyị dị icheiche ọ lụghị alụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Hyperrealism: 'A na m ese ihe maka ndụ ndị nnanna anyị'" 42834488,https://www.bbc.com/igbo/42834488,"Ụlọomeiwu Abia akwụsịla Jọstis Uzokwe,ọkaikpe steeti ahụ ọrụ n'ike","Ndị omebeiwu Abia Steeti ekwuola na ihe mere ha jiri kwụsị onye okaikpe Jọstis Theresa Ụzọkwe n'Abịa steeti ọrụ n'ike gunyere ebubo aka ike, imefu ego na ọgụ na mgba megide Chief Registra, na ndị okaikpe ndị ọzọ.","Onye Govanọ chịrị Abịa n'oge gara aga, bụ Theodore Orji tinyere Uzokwe n'okwa oka-ikpe n'Abia Steeti Na nzukọ mberede nke ha mere n'ụbọchị ọnwa Jenụwarị gbara ịrị abụọ na ise, ndị ụlọ omeiwu Abia Steeti kwụsịrị oka-ikpe steeti ahụ, bụ Justice Uzokwe ọrụ n'ike, ebe ha gwara Govanọ ka o tinye onye ọzọ. n'ọkwa rue mgbe kọmiti na-ewepụtara inyocha ebubo e boro Justice Uzokwe enwe mkpebi okwu. Ka ọ dị ugbua, Gọvanọ eduola Jọstis Obisike Orji iyi ọrụ dịka onye ga-na arụ ọrụ ka okaikpe nke steeti. Obisike Orji bụ ọkaikpe ọzọ kacha n'ọkwa na Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe n'Abia Steeti. Ebubo eboro ya Osote onye isi ụlọ omeiwu nke Abia Steeti bụ Cosmos Ndukwe gwara BBC na ha natara akwụkwọ mkpesa sitere n'aka ọtụ abụghị nke gọọment akpọrọ,""Global Peace Initiative ,"" nke bụ otu ndị oka-ikpe nọ na steetị ahụ. ""O nwere akwụkwọ ndebeta a detara anyị na ụlọ ọmeiwu. Ha dere otu o si na-akparị ndị jokaikpe ibe ya, otu o siri mee ka ọchịchị onye oka-ikpe dịka ọchịchị onye na-azụ ahia n'ime ahịa."" O kwuru na ụlọ omeiwu ahụ gbadoro ụkwụ na Section 296 nke iwu ala anyị nke nyere ụlọ omeiwu nke steeti ikike iwepu okaikpe mere ihe ekwesịghị ọkpụkpọ ya. Ọ gara n'ihu kwue na ha ewepụtala kọmịiti ga-elebanye anya n'ebubo ndị ahụ ma nye Justice Uzokwe ohere ị zara ọnụ ya. Cheta na ọ bụ onye Govanọ chịrị Abịa Steeti n'oge gara aga, bụ Theodore Orji tinyere Justice Uzokwe na'ọkwa dịka ọkaikpe Abia Steeti n'onwa December dị ịrị abụọ na abụọ. Akụkọ a ka na-abịa n'uju." afirika-51203625,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51203625,Enugu Fuel Crisis: Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN,Otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala akọwaala ihe ha ji gbaa abụbụ ọrụ n'Enugwu n'ụbọchị Tuzde nke tinyere ọtụtụ ndị mmadụ na gbagharịa.,"Ụkọ mmanụ ụgbọala bụ nsogbu ekweghị ala ala na Naịjiria Onyeisi otu a bụ Chinedu Anyaso kwuru na abụbụ ọrụ ahụ bụ iji mee ka Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi mepeere ha ụlọọrụ a kpọchiri akpọchi. Anyaso kwuru na kamgbe ha batara n'ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2019, isi ụlọọrụ ha kpọchiri akpọchi. O kwukwara na ha edeela akwụkwọ degara ndị uweojii, DSS, nakwa ụlọọrụ gọvanọ, mana onweghị onye ṅara ha ntị Chinedu Anyaso bụ onyeisi otu 'Independent Petroleum Marketers Association' (IPMAN) nke Enugwu steeti Anyaso gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị isi otu IPMAN n'Abuja nyere ha ikike ka ha kpọchịe ụlọahịa 'petrol' niile dị n'Enugwu. Ha machikwara ụgbọala tanka niile bu 'petrol' ịbata n'Enugwu. Nke a mere ka Gọvanọ kpọọ ha oku udo, ma mechaa nye iwu ka a kpọghee ụlọọrụ ha. Boko Haram ga-akwụ ụgwọ ihe ha mere - Muhammadu Buhari Muhammadu Buhari Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buharị akatọọla ogbugbu Lawan Andimi bụ onyeisi ndị ofufe Kraịst n'obodo Michika dị n'Adamawa Steeti, bụ onye ndị otu oyiegwu gburu, na-agbanyeghị na ha gosipụtara na ha chọbụru ịhapụ ya. Buahrị kwuru na ọ ga-agbalị na ndị oyi egwu a ga-erite ụgwọ ihe ha mere n'uju ya. O tiri ndị ofufe kraịst niile na Naijirịa, ndị otu CAN na ndị ezinaụlọ ya aka n'obi ma sị ka ụwa niile tinye aka ka a kwụsị ndị otu oyiegwu a niile. Ma sịkwa na ""Nke a agbaala ha ume dịka ndị gọọmentị na ndị agha Naijirịa imeri ndị otu oyi egwu niile na Naijirịa ma na ọdida anyanwụ Afrịka. Ọzọkwa Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe, Mariam Katagum Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ngalaba na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe ntuziaka ka a rụọ ụlọọrụ ji ihe akọpụtara n'ubi arụpụta ngwaahịa na steeti niile dị na Naịjirịa. Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe bụ Mariam Katagum kwuru nke a ụbọchị Wenezde. Katagum kwuru na atụmatụ ahụ ga-eme ka akụnụba Naịjirịa bawanye, ma mekwaa ka nri dị n'uju n'obodo Naijira na Briten Dịka a na-eme emume UK-african Investment summit Mba Briten na Naijirịa enweela nkwekọrịta itinye ego n'azụmahịa nke ruru otu ijeri naịra na iri ise na atọ na ọma. Ọ bụ na nzụkọ UK-Africa summit na-eme na Lọndọn ugbua ka ndị oji ego achụ ego nke mba UK na Naijirịa nwere nkwekọrịta a. N'Ofesi, Nje Corona Virus na-enye Chịna nsogbu Ọrịa si na nje coronavirus nke sitere na China selite isi na-esinwanye ike dịka ndị na-ahu maka ahụike na mba ahụ kwuru na nje ahụ nwere ikike ịmụba onwe ya, nke ga-eme ka ọ gbasaa n'ike. Ka ọ dị ugbua, ọrịa a egbuola mmadụ itoolu ma gbasaa ruo mba Amerịka,Taịland na Saụt Korịa. N'Egwuregwu Achụpụru David Luiz ma Arsenal mechara meria Ndị otu egwu bọolụ Arsenal sitere ọnwụ wee gbata onye lawa onye Lawa dịka ha zutere Chelsea n'asọmpi Premier League. N'agbanyeghị na ha dị naanị mmadụ iri agba ndị Chelsea zuru ezu, ha gbalịrị ịhụ na ha abụọ jị goolu abụọ abụọ were laa. Eniola Aluko Nwaada Nigeria bụ Eniola Aluko esonyerela ndị otu egwuregwu bọọlụ Aston Villa nke mba England dịka onyeisi nhazi egwuregwu maọbụ 'Sporting Director' na Bekee. Eniola bụ nwanne Sone Aluko onye gbaara ndị otu 'Super Eagles' nke Naịjirịa n'oge gara aga. Mana Eniola bụ ụmụnwaanyị mba Ịngland ka ọ nọchitere anya ha oge ọ na-agba bọọlụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-42992043,https://www.bbc.com/igbo/afirika-42992043,Sineti: Bịa kọwaara anyị ihe butere mwakpo ndị agha Kamerun,"Ndị bi na mpaghara Krọs Riva ebeela akwa maka ihe karịrị nde mmadụ abụọ ndị Kamerun na-enubata n'obodo ndị nọ n'agbataobi Naijiria na Kamerun, ebe akụkọ kwuru na ndị agha wakporo ndị Krọs Riva.","Onyeisi Kọmishọn na-ahụ maka obodo ndị nọ n'agbataobi Naijirịa na Kamerun akpọrọ State Border Communities Commission na bekee bụ Ambasadọ Ayang Azom Ayang gwara onye ntaakụkọ BBC na ""Anyị nwere nde mmadụ abụọ ndị si Kamerun gbata ọsọndụ n'obodo ndị bụ agbataobi anyị na ndị Kamerụn. Obodo dịka Ikọm, Ugep d.g.z. ""Ọnọdụ dị n'ebe ndị a dị oke ọjọọ. Ezinaụlọ ọbụla na ebe ndịa nwere mmadụ ruru mmadụ iri ise maọbụ iri isii ndị gbara ọsọndụ ha labatara."" O kwuru na nke a butere ụkọ ihe eji e nyere ndụ aka dịka mmiri, nri na ụlọmposi. O kwukwara na ""Izu abụọ garaaga ndị agha Kamerun wakporo obodo ndị dị na agbata Najiria na Kamerun."" Ayang kwetara na n'ezie, ndị agha Kamerun wakporo ndị bi n'mpaghara ahụ. Sineti kpọrọ Minista nchekwa ọkụ Ụnyaahụ, Sineti kpọrọ Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan Ali, ka ọ bia kọwa ihe mere ndị agha Kamerun na ndị obodo ahụ gbara ọsọndụ ji enubata n'ala Naijiria n'enweghị nsogbu ọbụla. Ụlọomeiwu ukwu kwuru na nnubata ndị si Kamerun gbaa ọsọndụ gbaga n'obodo Krọs Riva na ndị ọzọ dị n'agbataobi Najirịa na Kamerun nwere ike ibute nsogbu nchekwa. Ha kwukwara na nsogbu a nwekwara ike ime ka ịgba akwụna na mwakponike rịa elu. Sineti kwuru ka ndị agha Naijirịa zipu ndị otu ha ebe ahụ iji mee ka nchekwa sie ike na mpaghara ahụ. Otu onye bi n'Ikọm dị na Krọs Riva nke achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na ""ọtụtụ ndị ji ụgbọala ugegbe ya jiri eji nke bu akara mba Kamerun na-enubata. ""Anyị amaghị ma ndị nọ n'ime ha a bụ ndị agha Kamerun ka ha a bụ ndị uweojii.""" afirika-45394206,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45394206,Akụkọ kachasị taa: NYSC akọwala ihe mere Davido anọghị ebe ibe ya nọ,Ngalaba na-ahụ maka ife ala nna n'otu afọ bụ NYSC ekwuola na onye otiegwu bụ Davido naara ikike n'aka ha tupu ọ gaa njem na mba Amerịka.,"Akụkọ kachasị mkpa taa: Nke a na-apụta dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ Davido maka ị gawa njem ọrụ na Amerịka oge ndị ogbo ya ji otu afọ efe ala ha ka nọ n'ogige NYSC. Onye ọrụ NYSC gwara BBC n'ekwentị na Davido nara ikike a maka nchekwa na mkpuchi onwe ya mgbe o denyerechara aha ka ibe ya. Ọzọ, Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Ndị uweojii na Anambra steeti anwụchiela mmadụ ise gụnyere nwata dị afọ iri n'anọ maka iwakpo nwaanyị uche ezughi ezu n'ụmụnze dị n'okpuruọchịchị Orumba South. Nwaanyị ahụ ihe metụtara bụ onye Arondịzuogu kwuru na ha tọrọ nwa ya nwoke dị afọ atọ. Na mba ofesi Ndị mmadụ na-egosi iwe ha na soshal midia maka na onye ọkpa ọchị bụ Kevin Hart machiri ekwenti na mmemme ya emere n'ụbọchị ụka na mba Briten. N'uche ha, Kevin Hart nke Amerịka mefere ya bụ ihe oke n'ịmachi ihe dịka ekwentị N'egwurewgu Serena gbara dị afọ 36 nọzi na agba nke atọ na French opun Serena Williams etozuola ị ga agba nka anọ n'asọmpị US Open dịka o meriri Kaia Kanepi nke mba Estonia taa. Aha ya na-ewu ugbua dịka Serena Odogwu na Tennis kwuru na ọ ka chọrọ imụta ụmu abụọ n'ọdịnihu n'agbanyeghị na ọ tara ahụhụ ị mụ nwa nke mbụ ya. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo Atịtị Douglas Road N'ụtụtụ Super eagles Taa bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Septemba 2018 ka a ga-emepe ogige ebe Super Eagles ga-anọ mee nkwado maka izute Seychelles ịmata onye ga-etozu maka Iko mpaghara Afrịka. A na-atụ anya Henry Onyekuru, John Ogu, na ndị ọzọ. Ọdọ ụgbọelu Enugu Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugu nọ na ya ugbua. A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa September, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu ka ọ bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Bịanụ rụọ ọdọ ụgbọelu Enugu - Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ Na mba ofesi, Ọkụ agbapịala ụlọ ebe a na-edebe ihe ochie dị na Rio de Janeiro, isi obodo mba Brazil. Onyeisiala ha bụ Michael Temer kwuru na ihe ọkụ mebiri n'ụlọ ahụ gbara afọ narị abụọ, bụ ""ihe furu efu Brazil enweghị ike ịgbakọ."" Atụmatụ gọọmentị Gọọmentị etiti amapụtala ijeri naịra anọ na iri isii na asatọ a ga-etinye n'ịrụ ụzọ Lagos-Ibadan, akwammiri Niger nke abụọ, ụzọ East-West, ụzọ Abuja-Kano nakwa ọrụ ọdọ mmiri Mambilla. Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Nwaanyị mụrụ ejima anọ akọọla etu ya na di ya si chee afọ asaa tupu ihe iribeama a emee. Lee akukọ nwaanyi mụrụ ejima anọ" afirika-52914464,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52914464,Yangy rape case: Ihe uweojii kwuru maka nwa akwụkwọ a sị wakporo ụmụnwaanyị 24,"Kamgbe akụkọ Omozuwa Uwavera, nwagbọghọ Mahadum Benin a wakporo ma gbuo pụtachara ka akụkọ mwakpo malitere ịrị ibe elu na Naịjirịa.","Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-apụtazi na soshia midia na-akọ nakwa akpọ aha onye wakpọrọ ha n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ. N'ime mkpughie niile a, o nwere otu nwaokoroọbịa ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a kpụ n'ọnụ na ọ wakporo ha n'ụzọ di iche iche. End of Twitter post, 1 Nke a mere aha na foto nwamadị a ji na-ewu na soshal midia dịka ụmụ Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu sị ka ndị uweojii gaa nwụchie ya. Ụmụnwaanyị a dị iri abụọ na anọ boro ebubo na nwaokoroọbịa a kpọrọ Yangy wakporo ha n'otu n'otu. Ha sị na ọ bụ nwata ụlọakwụkwọ Mahadum Babcock dị n'Ogun Steeti ma biri n'obodo Pọthacọt dị na Rivers Steeti. Mana akụkọ pụtara n'Instagram ebe nwokoroọbịa a pụtara kwuo na aka ya adịghị n'ebubo ahụ. BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivers Steeti bụ Nnamdi Omoni, onye kwuru na ha anụbeghi maka nke a. Ọ sị na o nwebeghi onye bịara mee mkpesa banyere ya, na o nweghi ihe ọbụla ha ga-eme maọbụrụ na mkpesa abịaghị. Ihe ise nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru Mahadum Babcock bụ Joshua Suleiman gwara BBC Igbo sị na onweghi okwu ha nwere banyere nke ahụ ugbua. Suleiman jụrụ ikwu ma nwaokoroọbịa (Yangy) ọ bụ nwata akwụkwọ ha kaọbụ na ọ bụghị. Kama ọ sị na mgbe ọbụla ụlọakwụkwọ Babcock nwere okwu na ha ga-eme ka ọha mara. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmepe ala Igbo dị Igbo n'aka" afirika-55393963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55393963,New coronavirus restriction: Tupu ị palie njem lawa ala Igbo lekwa iwu coronavirus na-achị obodo gị,Dịka ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-akwado ime njem ekeresimesi n'oge coronavirus a.,"Ọtụtụ gọvanọ Steetị dị iche iche gụnyere ndị Ọwụwanyanwụ etinyela ụfọdụ iwu ga-ebelata mfesasị ọrịa coronavirus dịka a na-agba ekeresimesi. Nke a na-abịa dịka minista ahụike bụ Osagie Ehanire sị ka e mepegharịa ụlọ nnyocha, ụlọ ndopu iche nakwa ụlọ ọgwụgwọ niile. Ọ sị na ọ dịka Naịjirịa abanyela n'agba abụọ nke coronavirus a site n'etu ọnụọgụgụ si arị elu. Imo Steetị Etu ndị omeiwu Imo steeti 13 si bute coronavirus- Maurice Iwu Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma wepụtara ozi ịdọ aka na ntị maka mfesasị ọrịa coronavirus n'oge ekeresimesi a. Iwu ndị gụnyere: Anambra Steetị Kọmishọna mgbasaozi n'Anambra Steetị bụ Don Adenuba wepụtara ozi ịdọ aka na ntị nke gọọmentị ha. Ọ sị ka ndị mmadụ ghara ịga mmemme ọbụla na-adịghị mkpa, ka ha ghara ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ. Ka ha gbalịa na-ekpuchi ime ha n'ọha n'oge niile. Onye ọbụla ahụ na-arịa gbaa mbọ mee nyocha ahụ. Ebonyi Steetị Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus Na mgbasaozi Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Dave Umahi nyere n'ụbọchị 18 ọnwa Disemba, ọ sị ka ndị Ebonyi gbasoo iwu niile na-echekwa coronavirus. Ọ sị ka ebe okpukperechi niile na-enwe ofufe naanị awa abụọ, ka e welite aka n'ime nyocha ahụ. Machie ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ, onye ọbụla ga-ekpuchi imi n'ọha. O nyekwara iwu ka ụlọọrụ gọọmentị, ụlọụka, ụlọakwụkọ na ụlọọrụ niile dị n'Imo Steetị gbaso iwu na-achị coronavirus. Steetị ndị dịka Abia, Enugwu, Legọs ndị ọzọ tinyekwara iwu ọhụrụ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Nwoke jị ọkụ ese ihe" afirika-52581711,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52581711,"Covid-19 : 'Gọọmentị si anyị kwụọ N545,600 maka isi Chaịna lọta'",Naijiria. esonyela ọtụtụ mba dị iche iche na-agba mbọ ịkpọlata ndị nke ha nọ mba dị ọzọ maka Coronavirus na-awakpo ụwa niile ugbua.,"Ihea bụ foto ochie na-egosi ndị si Saụt Afrịka lọta mana ụmụ Naijiria nọ Chaịna na-atụ arịrị maka nnukwu ego gọọmentị na-ana ha iji kpọlata ha, nke ha kwuru dị oke ọnụ. Nwaafọ Igbo na-agụ akwụkwọ na mba Chaịna aha ya bụ Chukwuma Nzube gwara BBC Igbo na, a gwara ndị chọrọ ịlọta ha kwụọ N545,600 bụ ụgwọ ụgbọelu, dịka gọọmenti etiti na ụlọorụ AirPeace kpebiriela ị bịa buru na nabalị iri na asatọ nke ọnwa Mee. O kwuru na a gwara ha ka ha kwụọ ụgwọ a tupu ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee afọ 2020. Mana ụfọdụ ụmụ Naijiria nọ Chaina na-atụ arịrị na ego ahụ karịrị akarị. Dịka otu onye n'ime ha bụ Michael Okeke sị kwuo, ""Kedu ihe e ji sị anyị kwụọ $1,240 maka ịlọta? Anyị nọ n'ime ụlọ ọnwa atọ. Kedu ebe ego a ga-esi bịa?"" Ebe Idogwu Obiora kwuru sị na ""ndị nọ na Chaịna na-edi mmegbu , oteela aka anyị chewara ka gọọmentị bịa kpọpụ anyị"". N'otu aka ahụ, Akachukwu Nnenna Grace kwuru sị "" ọtụtụ ndị mmadụ enweghị ego. Ụfọdụ enweghị ụlọ ma ụfodu enweghị ego ha ji eri nri."" Coronavirus in 60 seconds: A na-agwọta coronavirus agwọta? Nzube kọwara na tupu coronavirus ebido, na ihe ha na-akwụ erụghị ego a gọọmentị sị ka a kwụọ. Ọ kọwawara na a na-akwụ N200,000 maka isi Chaina lọta Naijiria, ebe o na-eri 480 ije ma lọtakwa Chaina. Mana Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyema kwuru na ọ ghọtara na ihe siri ụmụ Naijirịa nọ na Chaina ike kama ya na ngalaba gbata gbata bụ NEMA na-atule etu ha ga-esi wetulata ụgwọ ndịa ga-akwụ. N'otu aka ahụ o kwuru na Naijirịa adịla njikere maka nlekọta na idopu ndị a kpọtara iche. N'abalị Wenezde, a kpọlatara ụfọdụ ụmụ Naijiria dị 256 site na Dubai." afirika-44935544,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44935544,Ndị ụlọomeiwu nta 38 hapụrụ APC gafee PDP na pati ndị ọzọ,"Na-atụfughị oge ọtụtụ ndị ụlọomeiwu Sineti sicha na pati APC gafee PDP, ndị ụlọomeiwu nta ruru mmadụ iri atọ na asatọ si na pati dị iche iche agafeela PDP.","Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari Nke a mere dịka ha nụrụ kepukepu na ndị ogbo ha nọ n'ụlọomeiwu sineti gafere n'otu PDP. Oke ọpụpụ a ebutele arụmụka n'etiti ndị pati APC na PDP maka ndị nwe ụlọomeiwu ugbua. Ndị gụnyere mmadụ anọ ndị APC gụnyere Olasupun Abiodun, Olubemi Samson na Akintola Taiwo si n'Oyo Steeti baa pati 'African Democratic Party' (ADP). Ndị nke gara pati PDP dị mmadụ iri atọ na anọ gụnyere Sani Ranu, Aliyu Madaki, Dickson Takiu, Shehu Usman, Nasuru Garu, Garba Umar, Olayonu Dokpe, Emmanuel Udendi, Aminu Shehu Shagari, Kabiru Maraba, Abdulsaman Dasuki na ndị ọzọ. Onyeisi ụlọomeiwu nta gụpụtara nke a site n'akwụkwọ ndị a degara ya. Ndi pati APC ji obi ụtọ nabata ndị a batara n'otu dịka ha gosiri ya n'akara twitter ha. Ndị pati APC kwuru na-agbanyeghi nke a mere, na ha kwụ chịm n'ala dịka pati nọ n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46864884,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46864884,Asset Declaration: Ndị Naijiria welitere isi gọọmenti etiti kpụpụrụla n'ụlọikpe CCT,"Mkpụpụ gọọmentị etiti kpụpụrụ ọkaikpe ukwu Naiijiria bụ ọkaikpe Walter Nkanu Ọnnoghen, ka na-akpọtụ.","Cheta na a kpụpụrụ ya n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal, maka ebubo na o kwuputachaghị ngwongwo nakwa akụ niile o nwere tupu e mee ya nnukwu ọkaikpe. BBC Igbo mere nchọpụta maka mmadụ atọ ọzọ gbara elu na Naijiria bụkwa ndị a kpụpụrụ n'ụlọikpe a. Bukola Saraki Bukola Saraki bụbu Gọvanọ Kwara steeti tupu ọ banye ụlọomeiwu Onyeisi oche ụlọnzukọ Senate bụ Bukola Saraki wụchiri n'ụlọikpe nke Code of Conduct, n'ụbọchị iri abụọ na abụọ ọnwa Septemba, 2015, iji zara ọnụ ya maka ebubo eboro ya na o gosipụtachaghị ihe niile o nwere mgbe ọ bụụrụ Gọvanọ na-achị steeti Kwara. E bokwara ya ebubo na onwere ego dị iche iche n'ụlọ ọbaego dị na mba ofesi. Mana ụlọikpe ekpechaa ọgwụ nke Naijiria nọọrọ n'ụbọchị ise nke ọnwa Julai, 2018, kachapụ ebubo niile ndị a, ma tọhapụ Saraki. Ike Ekweremadu Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata N'otu aka ahụ, ọchịchị etiti nọọrọ n'ụbọchị iri nke ọnwa Ọktoba, 2018, ma kpụpụ osote onyeisi ụlọnzukọ senate bụ Ike Ekweremadụ n'ụlọikpe CCT n'ihi ebubo na o kwupụtachaghị ngwongwo nakwa akụnaụba niile o nwere dịka iwu siri dị. Ihe ndị a gụnyere: ụlọ abụọ na mba UK, asatọ na mba Dubai, atọ na Florida, nakwa mba Amerịka. Bola Ahmed Tinubu 'Edemede ahụ bụ nke aghụghọ' Na-aka nke ọzọ, ọchịchị etiti nọọrọ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Septemba 2011, ma kpụpụ onye Gọvanọ chịbuuru steeti Legos bụ Bola Tinubu n'ụlọikpe CCT, n'ihi ebubo na o tinyere ego n'ụlọ ọbaego dị na mba ofesi site n'afọ 1999 rue 2007. Mana ụlọikpe a nọọrọ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Septemba, 2011, ma kachapụ akwụkwọ a a gbara megide Tinubu, kọwakwaa ya dịka nke nwere ntụpọ n'iwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45059354,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45059354,A gbagbuola ndị na-agbanwe ego mmadụ anọ na Port Harcourt,Ndị ntorobịa anọ aghọọla ozu ka a ghachara mgbọ n'ime obodo Oroazi dị n'okpuru ọchịchị Obi Akpor dị na Rivas State.,"Oroazi dị na Pọtakọt bú ebe ndí na-agbanwe ego na-anó Sherif Musbau Ibrahim bụ onye isi otu jikọrọ ndị ugwu na-azụ ahịa na Rivas steeti a kpọrọ 'Northern Traders Association of Nigeria', gwara BBC na mmadụ anọ n'ime ndị otu ha nwụrụ na mmekpa ahụ ndị gụnyere osote onyeisi ha bụ Yusuf Abubakar. O kwukwara na otu nwata nwoke ya na ya na-azụkọ ahịa aha ya bụ Rabiu Damala so na ndị a gbagburu. Ndị ọzọ gụnyere Adamu Tukur nakwa Sadiq Yusuf. Sherif kwuru ""Mmadụ anọ ndị otu anyị nwụnarịrị anyị, mana anyị anaghị ebo onye ọbụla ebubo kama anyị hapụrụ Chineke ihe niile. Anyị na-ekpe ekpere ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndokwa."" Sherif gara n'ihu kwuo na e bulala ha Bauchi maka olili ozu. Akụkọ kwuru na mmadụ isii nọ n'ihu ukwu osisi Oroazi na-ezu ike oge ndị bu egbe wakporo gbawa ha egbe nke gburu mmadụ anọ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni, kwuru na ihe mere n'ezie ma kwukwa na ha na-enyocha ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47621642,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47621642,Election Tribunal: Gọvanọ ndị nwetara ikike ọchịchị n'aka ụlọikpe,Akụkọ na-ewu ewu ugbua bụ na Atiku Abubakar nakwa otu PDP azọnyela ụkwụ n'ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala 2019.,"N'ime ihe ndị ha rịọrọ ụlọịkpe, ha kwuru ka akagbuo ntuliaka ahụ ma megharịa ya ọzọ. Ụlọikpe azabeghi ha iji kwu ụbọchị a ga-ebido ikpe a mana anyị chọrọ ịlebanye anya ndị zọtara ọchịchị n'aka ụlọikpe. Peter Obi. Otu ụlọikpe n'Enugwu kagburu mmeri Chris Ngige na ntuliaka emere n'afọ 2003 were nye Peter Obi ikike ọchịchị n'afọ 2006. O meriri Ngige zọrọ ọkwa n'okpuru PDP ebe ọ zọrọ n'okpuru APGA. Adams Oshiomhole Ọ bụ ụlọikpe pụrụiche n'ihe ntuliaka nyere Oshiomhole mmeri n'afọ 2008 mgbe ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru AC. O meriri Oserheimen Osunbor nke PDP iji zọta ya bụ ọkwa. Rauf Aregbesola Rauf Aregbesola bụ aka chịbụru Ọsụn steeti zọtara ikike ọchịchị n'afọ 2007 mgbe ọ gara ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka afọ ahụ. Ụlọikpe ahụ kwukwara na Olagunsoye Oyinlola kwesiri ịpụ n'ụlọ gọọmentị ebe ọ nọ dịka gọvanọ. Rotimi Amaechi Okwu Rotimi Amaechi pụrụiche n'ihi na ọ zọghị ọkwa na ntuliaka nke afọ 2007 chacha. Ebe o si nweta mmeri bụ mgbe ọ gara ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka imeụlọ nke otu ya bụ PDP mere iji họpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa Gọvanọ. Mmeri ya bụ ihe ịtụ anya diri ndị mmadụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-54364103,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54364103,Lee ọrụ ndị i kwesịrị ịtụ anya ha n'aka ndị nnọchiteanya gị n'ụlọomeiwu,Uru kachasị mkpa dị n'ime ọchịchị onye kwuo uche ya (ọhakarasị) bụ mwulite ndụ ndị mmadụ na mmepe ime obodo.,"Mana ọrụ mwulite obodo bụ otu okwu dị ezigbote mkpa na Naịjirịa kamgbe a banyere ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999. Nke a malitere na mbido ọchịchị Onyeisiala Olusegun Obasanjo n'afọ 1999 mgbe ndịisi ụlọomeiwu gakwuuru ndịisi ọchịchị etiti ka e nye ha ikike ịrụ ọrụ mwulite obodo 'Constituency project'. Ha sị na nke a bụ site n'ọchịchọ ndị ha na-anọchiteanya ha maka ikete oke n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Ndịisi gọọmentị etiti kwenyere ma nye ndị omeiwu ikike na nkwado site n'ịmawapụtara ha ego. Ndị obodo na-enweghi ezi mmiri ọṅụṅụ Mana i legharịa anya n'ọtụtụ obodo ugbua, ọ dịghị ka mwulite obodo ọ na-aga n'ihu na-agbanyeghi ego ndị gọọmentị na-ewepụta maka ya. Ya mere ka anyị tulee ihe bụ 'constituency project' na ndị ọ dị n'aka ịhụ na ewulitere ime obodo. Gịnị bụ 'constituency project'? Onye omeiwu na-ekwuchite ọnụ ndị ụlọomeiwu nta bụ Benjamin Kalu sị na ọ bụ ọrụ ndịomeiwu na-arụrụ ndị ha na-anọchite anya ha. Na ọ bụ ọrụ mmepe obodo ndịomeiwu na-arụ iji zaa oku ndị ha na-achị na-akpọ maka mwulite ndụ na obodo ha. Ọ bụ ọrụ na-egosi na anya, ụkwụ nakwa aka gọọmentị na-eru n'imime obodo dị na mba ahụ. Okporoụzọ ọjọọ N'oge ngụkọ mkpata na mmefu nke afọ ọbụla ndị omeiwu na-ekwupụta ọtụtụ ọrụrụ dị iche iche a ga-arụ na mpaghara ha na-anọchiteanya ha na ego ole ha ga-efu. Iwu Naịjirịa nke afọ 1999 nyere ndị omeiwu ikike ka ha kwupụta ego ndị gọọmentị ga-emefu n'ọrụ ndị a dịka ọ dị na-agba 80, amaokwu nke (2, 3 na 4). Kedụ ndị ọ dị n'aka ịrụ 'constituency project'? E nweela ọtụtụ nrụrịtaụka banyere ndị ọ dị n'aka ha ịhụ na a rụrụ ọrụ mwulite obodo n'etiti ndị omeiwu (legislatives) na ndịisi gọọmentị etiti (Executives). Nke a bụ eziokwu bụ na ọ dị ngalaba gọọmentị abuọ a n'aka ịhụ na ndị a na-achị ketere oke n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Kalu sị na ọrụ ndị omeiwu bụ ịga na mpaghara niile ha na-anọchiteanya ha ma chọpụta ọrụ ndị ahụ kwesịrị ka a rụọ n'obodo dịka ọchịchọ ndị obodo si dị. Ha na-eme nke a site n'ịkpo ime obodo nke ndịeze, ndịisi ntoroọbịa, ndị nne, ndịisi okpukperechi ga-eso bụkwanụ ebe ndị obodo ga-ekwu ihe ha chọrọ. Ọ bụghị ndị omeiwu ga-ahọrọ ọrụ masịrị ha kama ọ bụ ndị obodo ka ọ dị n'aka ikwu ihe ndị ha chọrọ ka gọọmentị rụọrọ ha. Ọ sị na ndị omeiwu ga-eji ihe ndị a gaa ọgbakọ ndị ụlọomeiwu ka e nwee ike tinye n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ ahụ. Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị etiti kwadọ ya, onyeisiala ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu ahụ. Ọ bụ zi ndịisi gọọmentị etiti ka ọ dị n'aka ịhọpụta ndị ọrụ ngo ga-arụ ọrụ ndị a n'obodo dị iche iche. Ụlọakwụkwọ nke nkiti dị na Lekki, Legọs. Ndị aka esighi ike adịghị etinye ụmụ ha na ụdịrị ụlọakwụkwọ a Mana ndị omeiwu na ndịisi gọọmentị etiti ga-agbakọ aka ọnụ tinyere ndị ọrụ ngo ahụ anya iji hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma nakwa n'oge kwesịrị. N'aka nke ọzọ, ọ bụghị naanị ndị ụlọomeiwu na ndịisi gọọmentị etiti ka ọrụ mwulite obodo dị n'aka kama ndị gọvanọ steetị nakwa ndị omeiwu steetị nwekwara oke ha n'ọrụ mwulite obodo. Nke a bụ maka na mpaghara steetị niile dị n'okpuru gọvanọ ya mere gọvanọ nwere oke na ọrụ iwulite obodo dị n'ime steetị ọ na-achị ya. Ọmụmaatụ ụfọdụ ọrụ mwulite obodo Omeiwu Kalu sị na sị na ọtụtụ ha na-arụ iji wulite obodo nke a kpọrọ 'consttuency project' na bekee gụnyere;" afirika-47844013,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844013,2019 WWE WrestleMania 35: Kofi chiri Bryan ọnụ n'ala,Nwaafọ Ghana aha ya bụ Kofi Kingston abụrụla onye isi oji abụọ tụtụ ugo na egwuregwu mgba WrestleMania nke ngalaba WWE.,"Maazị Kingston pụtakwara dịka onye isi oji nke anọ bụ ọka ibe na egwuregwu wrestling nke ụdị a n'ụwa dum. Ndi oso na-azu bụ mmadụ dịka Mark Henry, Booker T nakwa The Rock. Mmadụ 80,000 pụtara ikiri mgba a ka Kingston ji agbam ụkwụ ejiri mara ya akpọrọ ""Trouble in Paradise"" na Bekee gbatuo Daniel Bryan. Ndị egwuregwu ""wrestling"" na-amasị nwere ezigbote aṅụrị etu mgba jiri gaa. End of Twitter post, 1 Kofi Kingston anọrọla afọ iri na abụọ na ngalaba WWE. Ihe ị maghị maka Kofi Kingston Kofi Kingston ka o merichara Kofi Kingston ka o merichara 1. A ma ya dịka Kofi Kingston mana ezi aha nwa afọ Ghana a bụ dimkpa ka ibe ya nke WWE ugbua bụ Kofi Nahaje Sarkodie-Mensah 2. Kofi bụ onye isi ojii Afrika mbụ ga-erite nzere ọkaibe na mba ụwa na WWE dịka a na-arụbu WWE aka ikpa oke agbụrụ 3. Kofi na-azabu onye Jamaica ọtụtụ afọ ọ nọ na-agba mgba n'Amerịka dịka a mara ya oge ahụ dịka Kofi Nahaje Kingston 4. Ọ bụ nne ya gbara ya n'anwụ na ọ bụ onye Ghana, na ọ bụghị onye Jamaica nke mere ka Kofi machiere nne ya na ndị ezịnaụlọ ya ịgwa ndị ntaakụkọ ihe ọ bụla banyere ya 5. Kofi dị afọ iri atọ na asaa alụọla nwaanyị ma mụta ụmụaka nwoke abụọ Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-43708728,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43708728,Yulia Skripal na nna ya e nyere nsi na UK adịla mma,Yulia Skripal bụ onye e nyere ya na nna ya Sergei Skripa nsi na mba Briten n'ọnwa gara aga apụọla n'ụlọgwụ ebe ọ na-anatabu ọgwụgwọ.,"Sergei Skripal afọ 66, na nwa ya Yulia dị afọ 33 nọ n'ọnọdụ dị egwu n'ụlọ ọgwụ Onye kwuru nke a ụị onyeisi ụlọọgwụ, Salisbury District bụ Christine Blanshard, n'okwu ya, ""Anyị ahapụlaa Yulia. Nna ya naha adịkwa mma, ụbọchị Fraide, e kwuru m na ọ nọghịzị n'ọnọdụ ize ndụ mana ọgwụgwọ ya anaghị aga ọsịsọ ka nke Yulia. Anyị na-ele anya na ya onwe ga-apụa n'ụlọọgwụ n'ọdịnaihu."" Cheta na mba UK boro mba Rọshịa ebubo na ha zitere ndị nyere mmadụ abụọ ahụ nsị n'ala UK. Nke a mere mba UK na mba ndị ọzọ ruru 20 na mpaghara Yurop ji chụpụ ndị ọrụ Rọshịa nọ na mba ha maka ya bụ nsị. Mana Rọshịa kwusiri ike na ha emeghi ihe ọbụla. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-51691499,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51691499,Watford vs Liverpool: Watford azọpịasiala Liverpool ka awarawa tomanto,Ndị otu Watford emenyela ndị Liverpool egwu taa n'be ha na Vicarage Road.,"Na agbanyeghị na Liverpool ka bụ ndị mbụ n'asọmpị Premier League, kama mmerị a Watford ji ọkpu goolu atọ asataghị ma ncha merie ha tụrụ mmadụ nile n'anya. Onye ndụ ha bụ Virgil Van Dijk kwuru na ndị Watford gbara ọfụma nke bụ na mmerị ha kwesịri ekwesị. Van Dijk sị kwa na ọcheghị na ha mepụtara ohere inye goolu ma sị kwa na goolu atọ a tụrụ ha n'anya." afirika-45786968,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45786968,2019 Elections: 'Ma Buhari ma Atiku abụghị onye nzọpụta Naijiria',O dola ewu na ọkụkọ anya na ntuliaka 2019 maka ọkwa onyeisiala ga-abụ n'etiti onyeisiala Muhammadu Buhari na nke APC na Atiku Abubakar nke PDP.,"Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019 Atiku meriri na ntuliaka imeụlo PDP mere abalị ole na ole gara aga ebe ọ kpụchapụrụ Bukola Saraki na Aminu Tambuwal na mmadụ asatọ ndị ọzọ zọrọ ọkwa ahụ na Pọthakọt. Mana ajụjụ a kpụ n'ọnụ bụ kedụ mpụtara ihe mere na ntuliaka imeụlọ PDP ahụ? Kedụ onye n'ime mmadụ abụọ ndị ahụ ga-aza ekpere ndị Naijiria ka ala dị mma? Kedu ihe o jiri bụrụ naanị Buhari na Atiku na-ewu ebe ndị ọzọ sokwa n'ọsọ onye ga-abụ onyeisiala? Mpụtara PDP Convention Atiku meriri Bukola Saraki na Aminu Tambuwal na mmadụ asatọ na ntuliaka imeụlọ PDP mere na Pọtakọt Akụkọ kwuru ka ego bekee siri si aka fere aka na ntuliaka imeụlọ PDP. Ọkacharamara n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ onye nchịkọta otu a kpọrọ 'Human Rights Volunteer Corps' bụ Larry Oguego kwuru na ihe mere na Pọtakọt bụ ""Bazaar nke onye wepụta ego karịa buru ihe e rere lawa."" Atiku na Buhari abụghị ihe Naịjirịa chọrọ - Oguego Oguego kwuru na nke na-egosi na otu PDP amụtabeghị ihe n'ihe mere ha oge gara aga nke ha na adịbeghị nkwadobe ịchọ onye ga-eduga Naijiria n'ụwa ọma. Ọ sịrị: ""Ihe obodo anyi chọrọ bụ ka a họpụta onye nwere ebumnobi obodo anyị, onye ga-akwụsị ngarị."" Ma Atiku,ma Buhari agaghị azọpụtali Naijiria Oguego: Ka ọdị ụmụ Naijiria ma Buhari banye ọzọ ka ọ dị ma ọ bụrụ Atiku Oguego ekwuola na Atiku na Buhari abụghị ndị ga-azọpụta Naijiria n'ihi na ị họrọ otu n'ime ha bụ nnụnụ isi n'ala begoro na mkpu. "" Ma Atiku,ma Buhari enweghị onye ọ dị ka ọ bụ ya ga-eme ka Naijiria dị mma. ""Ihe anyị chọrọ bụ onye nwere akọ, nwe uche, nwe umeala. ""Onye a ga-asị nweta ego ka eke, ọ sị mba ka e were ya rụọ ọrụ. O metu ọgalanya ọ metụ ogbenye. "" Anyị chọrọ ọbara ọhụrụ, onye ga-ahazigharị ọnọdụ obodo anyị."" Ihe mere o jiga-abụ naanị Buhari na Atiku na ntuliaka 2019 Oguego kwuru na ndị ọbara dị ọkụ dịka Kingsley Moghalu, Donald Duke,Fela Durotoye, Oby Ezekwesili, Sowore agaghị enweli ike ịkwapụli Buhari na Atiku bụ ndị agba ochie n'ọkwa ọchịchị na 2019 n'ihi na ha e jikọghị ọnụ. ""Ọ bụrụ na ha jịkọtara ọnụ wepụta otụ onye ha ga-akwado ka ha ga-eme onwe ha ndị nke atọ. ""N'ihi na ha enweghị ụdị ego e ji azọ ndọrọndọrọ n'ala anyị nke ha na enwe aga-amara nke Atiku maọbụ Buharị nwere."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51983370,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51983370,Ignaz Semmelweis: Ihe asaa ị maghị maka nwoke chọpụtara ịkwọ aka,"Ụbọchị Fraide, Ụlọọrụ 'Google' chetara Ignaz Semmelweis n'ụzọ pụrụiche site n'iji foto ya e sere ese mee ihu ọba ozi ha iji kwanyere ya ugwu maka ịchọpụta uru ịkwọ aka bara n'ibelata nkesa ọrịa.","Ignaz Semmelweis mere nchọpụta gosiri na ịkwọ aka tuppu a naa nwaanyị nwa na-ebelata ọnwụ ụmụnwaaanyị na-amụ nwa Lee ihe ndị mere Ignaz Semmelweis oyoyo ị na-amaghị: 1. Ọ bụ onye dọkịta chọpụtara na e nwereike site n'ịkwọ aka belata ọrịa ahụọkụ na-egbụkarị ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'oge agba afọ 1800 na 1820, oge ụmụnwaanyị na-anwụ ka ọkụkọ n'ịmụ nwa. 2. Semmelweis gwara ndị dọkịta ka ha bido ịkwọ aka tupu ha a naa nwaanyị nwa. N'afọ 1847, wọọdụ ya mere ya, ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nwụrụ n'ịmụ nwa site na pasent 18.3 gbatuo rue pasent 2.2. 3. A mụrụ ya n'obodo Taban dị nso na Buda na Budapest n'afọ 1818. 4. Mana ndị dọkịta ibe ya kwara ya emo maka nchọpụta ya ma jụ ịgbaso nchọpụta ya n'ihi na ọ gbasoghi usoro ha na-esobu. 5. Ọ na-azubu ahịa tupu ọ lọgachị ụlọakwụkwọ gụọ maka ahụike. 6. Ọjụjụ a jụrụ nchọpụta ya mere ya butere ya obi ịda mba dịka ọ kpọrọ ndị dọkịta agbaso amụma ya 'ndị ọmụma egbu ọchụ', n'ihi na ha na-eji aka e ji naa otu nwaanyị nwa ga naa nwaanyị ọzọ. 7. A tụnyere ya n'ogige a na-elekọta ndị isi mgbaka ebe ọ nọọ nwụọ ka ọ gbachara afọ iri anọ na asaa (47) n'ihi abụ sochiri ihe ndị nche kụrụ ya. 8. Ọ bụ mgbe Semmelweis nwụchara ka ọha jiri were okwu ya kpọrọ ihe ma tinyekwa ya n'ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46719981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46719981,First baby: Kedụ onye bụ nwa mbụ a mụrụ n'Alaigbo n'afọ 2019?,"Na steeti ụfọdụ, ọ bụrụla omenala ịmata nwa mbụ a mụrụ n'afọ ọkachasị n'ụlọọgwụ ndị gọọmenti.","Nwa mbụ amụrụ n'ala Igbo na Rachel Umahi Nke a bụ emume nke nwaanyị mbụ bụ nwunye gọvanọ na steeti ụfọdụ ndị a. Otu a ka o si gaa na steeti ndị ụfọdụ n'Alaigbo. N'Ebonyi steeti Mary Nwojiji Akata mụrụ nwa mbụ n'ala Igbo Nwa mbụ amụrụ n'Alaigbo ụnyahụ bụ ụbọchị mbụ n'afọ ọhụrụ bụ amụrụ n'ezinaụlọ Nwojiji Akata nke OtereUvie dị na Ishieke dị na okpuru ọchịchị Ebonyi n'Ebonyi steeti. Amụrụ nwa a ka elekere iri an abụọ nke abalị kụrụ kpọm kwem na Mile 4 Mission Hospital Abakaliki, Ebonyi steeti. Nwa ohuru a bụ nwaanyị dara 4.1kg nke pụtara na-orijuru afọ n'afọ nne ya. Nwunye gọọvanọ bụ Rachel Umehị gakwara lete ya na ụmụaka ndị ọzọ. N'Anambara steeti, Nwunye gọvanọ Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano kwuru na Kamsi bụ ezigbo onyinye nye ndị Anambara Nwa mbụ a mụrụ n'afọ 2019 bụ Kamsi Eselu, onye a mụrụ oge o ji nkeji iri abụọ na anọ gafee elekere iri na abụọ (12:24 am) nke ụtụtụ Tuzde. A mụrụ Kamsi na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Teaching Hospital dị n'Ọka, Anambara steeti. Kamsi bụ diọkpara n'ezinaụlọ Eselu, bụ nwa mbụ nne ya bụ Obiageli na nna ya na-amụ. Na Delta steeti, Nwa mbụ a mụrụ na steeti ahụ bụ nwa a mụrụ n'ezinaụlọ Martin Dibia mgbe ọ kụrụ (1:20 am), ya bụ mgbe o ji nkeji iri abụọ gafee elekere mbụ nke isiụtụtụ na Federal Medical Centre Asaba. Odeakwụkwọ ukwu gọvanọ bụ Charles Aniagu sị na nwunye gọvanọ steeti ahụ bụ Dem Edith Okowa agaala leta ya bụ nwa nwaanyị nke nne ya bụ Ifeoma Martin Debie, ndị Issele-Asagba, Aniocha n'okpuru ọchịchị Aniocha-South nke Delta Steeti. Dame Edith Okowa nwunye Gọvanọ Delta steeti na nwa mbụ a mụrụ na Delta steeti na 2019 N'Abia steeti, Nwa mbụ a mụrụ na steeti ahụ bụ Jidenna Jesse Osondu, bụ onye a mụrụ mgbe o ji nkeji iri anọ na abụọ gafee elekere mbụ nke ụtụtụ. Jidenna na-anyị kilogram atọ oge a mụrụ ya A mụrụ Jidenna n'ụlọọgwụ Living Word Mission Hospital dị n'Aba, Abịa steeti. Nwunye aka na-achị Abịa steeti gara leta Jidenna n'ụlọọgwụ N'Enugwu steeti, Nwa mbụ a mụrụ n'Enugwu steeti bụ Akasike, bụ onye a mụrụ mgbe o ji nkeji asaa gafee elekere iri na abụọ nke isiụtụtụ. Ọ bụ nwa mbụ nne y6a bụ Chinecherem Akasike na nna ya na-amụ A mụrụ ya n'ụlọọgwụị ESUTH Parklane dị n'Enugwu. Nwunye aka na-achị Enugu steeti bịara leta ya n'ụlọọgwụ Akụkọ ga-amasị gị:" media-51570026,https://www.bbc.com/igbo/media-51570026,Sex for Grades: Onyenkuzi mahadum Legos eritela nga afọ iri abụo na otu,Atụọla onyenkuzi na Mahadum Legọs bụ Afeez Baruwa nga afọ iri abụo na otu maka iwakpo nwaagbọghọ gbara afọ iri na asatọ na-achọ ụzọ ibata Mahadum.,"Ọ bụ ọkaikpe Josephine Oyefeso kpere ya bụ ikpe na ụloikpe elu dị n'Abuja n'ụbọchị Frịde. Oyefeso kwuru sị 'Enweghị m ike ịghọta ihe nwatakịrị a na-agabiga maka mwakpo a. Onye a ikpe mara megidere nwata nwaanyị a, ezinụlọ ya, ndị agbata obi na Chineke'. Maka ngalaba ga-achịkọta ndị gbajọrọ Boko Haram. Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Atụmatụ iwu Ibrahim Gaidam na-anọchite Yobe East n'ụlọ omeiwu n'Abuja wepụtere n'ụbọchị Tọsde chọrọ ka ehibe ngalaba ga na-ahụ maka ndị gbajọrọ Boko Haram. Iwu a ọtụtụ ndi omeiwu na-agbarụrụ ihu chọrọ ka esepụtere ndị Boko Haram gbajọrọ ịkwa mgbọ ute nabata. Nke a na-abịa dịka ndị agha Naịjirịa kwuru na ha na-akuziri mmadụ 608 gbajọrọ Boko Haram etu ha ga-esi lọghachite ọha. Nke a bụ izizi a gụru iwu a n'ụlọ omeiwu. Gọọmentị Anambra agbapeela Ahịa 'Electronics' Nnewi Ya bụ ahịa Electronics Nnewi agbachiri kemgbe ụbọchị Tuzde amalitela ahịa ọzọ. Onye ahịa na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na gọọmentị ekwetala ka ha julata oyi maka ya bụ ahịa achọrọ ibufe n'ụzọ Nwaanyi Imo dị na Nnewi, Anambra steeti. Ndị ahịa sị na iwe ha ejighị chọọ ịpụ bụ maka na agwabụghị ha agwa tupu a sị ha puọ. Onye ahịa ahụ sị na ndị obodo tinyere ọnụ na ya bụ okwu bụ nke mere ka gọọmentị jụtụ oyi ka ha na ha nwe nghọta ka ya bụ ọpụpụ ga-esi dị. Dịka ka nwoke si tụọ n'ilu, ""akpaa akpa, arahụ n'ute"". Ihe nkiri maka Nnewi Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’? Ndị agha Naịjirịa na Borno steeti Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ekwuola na ndị agha Naịjirịa kwesiri iwe mmadụ otu puko narị ọzọ ka esonye ebuso Boko Haram agha. Zulum sịkwa na steeti ya kwesiri iwepụta ọkara n'ime ndị agha maka ọ bụ n'isi ụlọ ya ka ya bụ agha na-ada. Maka ndị Chaịna pịara nwata ihe na kenya Ụlọikpe na Kenya akagbuola akwụkwọ Minista maka ọdịmma imeobodo bụ Fred Matiang'i' tinyere aka maka ịchụla ndị Chaịna anọ. Ndị Chaịna anọ a ji ụtarị pịapụ onye isiojii na arụrụ ha ọrụ mkpụru ọkwụrụ na ya. Ịghalo abatala n'egwu A na-atụ anya na Odion Ighalo ga-eso malite egwu mgbe Manchester United ga-ezute Club Brugge n'asọmpi Europa League n'abalị Tọzde. Ighalo gbara asọmpị izizi ya oge Man Utd zutere Chelsea n'abalị Monde mana e tinyere ya ka ọ fọdụrụ nkeji ise ka asọmpi ahụ gwụ. Babagana Zulum na ọgụ Boko Haram Professor Babagana Umara Zulum visit Auno wia Boko Haram kill 30 passengers Dịka Boko Haram na otu Islamic State na-akpa ike na mpaghara ugwu aka na-achị Borno steeti bụ ebe ọkachasị metụta ekwuola ka ewere ibu ọnụ na ekpere sowe ya bu ihe. Gọvanọ Babagana Zulum si na-agbanyeghị etu ndị mmadụ ga-esi hụ oku a, ọnọdụ ya nọ mere ya bụru ihe ziri ezi. n̄Ọ sị na atụmatụ a ga-abụ enyemaka gụnyere ihe ndi agha na-eme. Okwu ya na-abịa dịka ndị omekome a wakporo otu obodo dị na Chibok ụnyaahụ. Ebumọnụ a ka eme ụbọchị 24 nke ọnwa Febụwarị. Ọkachamara Zulum sị na ya ga-ersoro buo ya bụ ọnụ. Ndị China sị na ọgwu ịba Chloroquine na-egbu coronavirus Ọgwụ ejibu agwọ ịba n'Afịrịka akpọrọ Chloroquine bụ ihe nagalaba na-ahụ maka sayensi na Cahịna sị na-erere ha n'ịgwọ ndị butere nje Coronavirus. Akụkọ si ụlọntaakụkọ gọọmentị akpọrọ China Global Televison Network sị na ndị ọkachamara maka nje kwekọrịtara na ọ bụ ọgwụ bụ ejecha agwụ maka nje a. Ọgwụ a na-erebu ọfụma maka ọgwụgwọ ịba tupu nje na-ebute ya bụ ọrịa bịara mara ya ahụ. Ụlọ ọrụ ntaakụkọ ọzọ akpọrọ Xinhua dekwara na a nwaara ọgwụ a na ụlọọgwụ iri na isi obodo Chaịna bụ Beijing nakwa mpaghara abụọ ọzọ. Ndị sị na haq anwụchiela onye eche na o gburu nwaanyị na-arụ n'Aso Rock Aka ndị uweojii akparala otu nwoke eche na aka ya dị na ogbugbu Laetitia Naankang Dagan bu onye na-arụ ọrụ n'obi onyeisiala n'Abuja. Ha sị na onye a aha ya bụ Edirin Ohonre 'abụwala abụọma' ka ha sị gbuo ya bụ ọchụ mana ọkpọtabeghị ọkaiwu ga-ekpechitere ya ọnụ ya. Ndị omekome a gburu nwada Laetitia Naankang Dagan gbara afọ iri anọ na asaa n'ụbọchị Monde n'ụlọ ya dị n'Abuja. Onyeisi ọrụ ya bụ nwaanyị na-ahụ maka mgbasaozi bụ Attah Esa sị na ya bụ nwanyị bụ onye Plateau steeti bịara ọrụ ụbọchị Mọnde bụ ebe ọ nọ rụọ elekere asatọ nke abalị, mana e gburu ya n'elekere iri na otu nke abalị. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Anjuguri Manzah sị ha jidere ya bụ nwoke site na ama ndị ngalaba nzuzo ndị uweojii a kpọrọ Criminal Investigation Department (CID) gbaara ha. Ha kwuru na ha chọpụtara na ya bụ nwoke e jidere nwere ndị ọzọ ya na ha kpara arụ a bụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua. Manzah dọrọ ọhaneze akanantị ka ha kpachara anya maka a sịrị ndị mmadụ na-akọ na soshal midia gbasara ogbugbu nwaanyi a. Ọrịa Lassa na LUTH Oke bụ anụmanụ n'ebu ọria lassa Ụnụ anụla na-edowela mmadụ iri isii na atọ ebe a ga-enyocha ha maka ịba lassa na Lagos University Teaching Hospital. Ụnyaahụ ka onyeisi ya bụ ụlọọgwụ bụ Akin Abayomi kwuputara na ya bụ ọrịa abatala Legọs. Ọchụ egburu na Hanau N'ofesi, ndị omekome egbuola mmadụ asatọ ma meruo mmadụ ise ahụ n'obodo Hanua dị na Germany. Ndị uweojii obodo ahụ sị na ha ka na-achọ ndị mere ya bụ ihe bụ ndị amabeghị uche ha. RB Leipzig na Tottenham N'egwuregwu, RB Leipzig ji otu ọkpụ gool merie Tottenham be ha ụbọchị Wenezde. N'otu aka ahụ Atalanta ji ọkpụ anọ asatara otu merie Valencia na be nke ha n'egwuregwu Champions League agbara ụnyaahụ. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" media-44020921,https://www.bbc.com/igbo/media-44020921,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob na Idika Kalu na-atụ onwe ha,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere nụtụtụ a n'ichafu: IPOB agọọla ebubo Kalu Idika Kalu,"IPOB agọọla ebubo onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka okwu gbasara ego bụ Kalu Idika Kalu boro ha na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọ ya. Onye odeeakwụkwọ mgbasaozi IPOB bụ Emma Powerful kwuru na ebubo ahụ na-atọ ọchị n'ihi na IPOB na Kalu enweghị mmekọrịta ọbụla nchancha. Powerful kwuru na IPOB ga-ekpe Kalu n'ulọikpe maka ebubo a. Ndị turu ugo na Headies David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode. Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' bụ nke bụ egwu kachasị. Ndị ọzọ nwetara nturugo bụ Wizkid, Simi, Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ. Mana ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo n'emume ahụ. Naịjirịa azụọla ugbọele abụọ na-atụ ogbunigwe Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari ekwuola na gọọmentị azụụla ụgbọelu abụọ na-atụ ogbunigwe maka ibuso ndị oyiegwu agha. Buhari kwuru na a zụrụ ụgbọelu a na-aka mba Russia n'ime ọnwa Epureelụ maka ụbọchị ncheta afọ iri ise na anọ ndị agha ụgbọelu Naịjirịa. Ogbunigwe adaala na Gaza Ụlọọgwụ dị na Gaza ekwuola na mmadụ isi n'ala Palestine anwụọla oge ogbunigwe dara na obodo Deir al-Balah n'ala ahụ. Onweghị onye mara onye tụrụ ogbunigwe nke a. Otu Hamas na-ebo mba Israel ebubo , mana Israel kwuru na aka ha adịghị na mkpamkpa ahụ. Alex Ferguson wara ahụ Onye bụbu onye nkuzi otu Manchester United bụ Alex Ferguson emeela iwaahụ nke ụbụrụ maka ọbara na-agba ya n'ime isi. Manchester United kwuru na ọ na-agbake ugbua. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 43695634,https://www.bbc.com/igbo/43695634,A gbaala dokịnta akwụkwọ maka itu ụmụnwaanyị 11 ime,"N'ọnwa Nọvemba, a gbara dọkịta Norman Barwin akwụkwọ ka nyocha DNA e mere gosipụtara na ọ bụ ya bụ nna nwa onye bụbụ onye ọrịa n'ụlọọgwụ.","Agbara Dkta Norman Barwin akwụkwọ makaebubo iji ọbaraọcha ya(sperm) tunye opeka mpe mmadụ abụọ ndị o nyere nleta maka ịmụta nwa Akụkọ maka ebubo a pụtara ihe n'ọnwa Novemba afọ gara aga ka Daniel na nwunye ya bụ Davina Dixon na nwa ha nwanyị bụ Rebecca gbara Dkta Barwin, Nelligan, O'Brien na Payne akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Ontario. Ezinaụlọ nwere mkpebi ịiwepụ okwu ahụ ụlọikpe ka ha chọpụtachara na Rebecca abụghị Maazị Dixon mụrụ ya. Ezịnaụlọ Dixon gakwuru Dkta Barwin n'afọ 1989 ka o nyere ha aka ịtụ ime, e mecha mụọ Rebecca na afọ na-eso ya. Dịka akwụkwọ ebubo ha siri kwu: ""Davina anọkwataghị n'ihi na ya na Daniel nwere anya na-acha ka ihu igwe, ebe Rebecca nwere aja na-acha aja,aja. Ha a mechara chọta onye ha chere na ọ bụ nwanne Rebeccam onye nne ya bụkwa otu nwaanyị garala nleta maka itụ ime n'aka Dkta Barwin. Ezinaụlọ Dixon chọpụtara n'afọ na Daniel abụghị nna mụrụ Rebecca. O pekata mpe mmadụ 11 na-ebo ebubo na ọ bụ ya bụ nna mụrụ ha, dịka ndị ọkaiwu ha siri kwuo. Ndị a na mmadụ iri ise(50) ndị ọzọ ndị nwetara nleta n'aka dọkịta ahụ ndị nyocha DNA ha eyighị nke onye ha kpọrọ nna mụrụ ha, ghbara ya akwụkwọ n'ụlọ ikpe. Ebubo gbadoro ụkwụ n'ihe mere kemgbe afọ 1970 ma metụta ụlọọgwụ abụọ na-ahụ maka inyere ndị ime na-esiri ike aka dị n'Ottawa, Ontario bụ Broadview Fertility Clinic na Ottawa General Hospital. Mana ọkaiwu Dkta Barwin bụ Karen Hamway dekweghị saa ebubo ndị a e boro nsonso a. Ndị ọkaiwu Peter Cronyn na Frances Shapiro Munn kwuru na ha hụrụ mmadụ iri na otu ndị nne na nna ga gara hụ Dkta Barwin maka inweta nleta gbara ime isi ike ndị bụ nwa ya dịka nyocha DNA ha mere siri gosipụta. Ụfọdụ bụ ndị e kwesịrị inweta nkwado ọbaraọcha(sperm) onye ha amaghị, ebe ụfọdụ bụ ndị kwesịrị inweta ọbaraọcha nke di ha. Ha hụkwara mmadụ iri na isii ndị e kwesiri iji ọbaraọcha nna ha mụọ mana nyocha DNA e mere eyghị nke nna ha. Dịka Cronyn na Shapiro Munn siri kwuo, n'ọnọdụ ndị a, amaghị ndị bụ nna mụrụ ha na'ezie. Ha gara n'ihu kwuo na e nwere mmadụ iri atọ na ise ndị e kwesiri ka e jiri ọbaraọcha ndị akpọghị aha ha ndị nwere ike ha agahị abụ ndị e chere na ha bụ. E nyebuọla Dkta Barwin n'afọ 2013 maka intinyere mmadụ atọ ọbaraọcha ekwesighị n'ụlọọgwụ ya dị n'Ottawa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43496100,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43496100,BBC: Anyi ga-akwalite mgbasa ozi ihe ọma na-eme n'Afrịka,"E mepere ụlọọrụ BBC nke mpaghara ọdịdaanyanwụ Afrịka na Lagos, Naịjirịa ụnyaahụ.","BBC chọrọ ịna agbasa akụkọ metụtara ụmụnwanyị na ụmụaka n'Afrịka Nke a na-esote mbido mgbasaozi nke asụsụ atọ dị na Naịjirịa bụ Pidgin, Igbo na Yoruba na mpaghara ahụ. N' okwu ya, onyeisi BBC World Service Group bụ Jamie Angus kwuru na mmepe ahụ ga-enye BBC World Service Group ohere ịgbasa akụkọ ihe oma na-eme n'Afrịka ebe akụkọ na-apụtakarị n'ụlọọrụ akụkọ mba ụwa bụ akụkọ banyere ọrịa, agha na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche. ""Nke a so n'ụzọ BBC sị akwalite ọganihu ọrụ ntaakụkọ na Nigeria ma nye aka ịgbasa ozi ihe ọma banyere Afrịka."" Mmepe nke ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria bịara weliri ọnụọgụgụ mgbasaozi n'asụsụ nke BBC na mpaghara na Naijiria ruo anọ; Igbo Yoruba, Hausa na Pidgin. Ndị echichi Igbo bịara ya Eze obodo Iwo dị n'Osun Steeti na nwunye ya biara Toyosi Ogunseye, onyeisi BBC na mpaghara Afrịka na Jamie Angus onyeisi BBC World Service na mmemme ahụ ụnyaahụ Ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara emume ahụ Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu n'igwe okwu, Twitter, maka ya: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52570103,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52570103,Coronavirus in Nigeria: Etu ndị Igbo si kenyere onwe ha 'palliatives',"Ọ bụ eziokwu na coronavirus na-akpa mkpa mkpa n'ụwa, ihe kachasị ọtụtụ mmadụ mkpa na Naịjirịa bụ ihe afọ ga-eri.","Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ tụmadụ ndị Igbo bido juwa maka ụfọdụ otu Igbo ama ama na enyemaka ha na-enye ndị Igbo n'oge coronavirus. Content is not available End of Facebook post, 1 BBC Igbo na ụfọdụ otu Igbo dị iche iche nwere mkparịtaụka, lee ihe ndị ha gwara anyị. Ohaneze ndị Igbo Nnia Nwodo onyendú Ohaneze Ndigbo Onyeisi Ohaneze ndị Igbo na Naịjirịa bụ Nnia Nwodo kwuru na ọ gaghị asa ajụjụ BBC Igbo jụrụ ya maka enyemaka otu nyerela ndị Igbo kamgbe ọrịa coronavirus na nsogbu o bu malitere na NaỊjirịa. O jụrụ sị, ""Anyị a bụ gọọmenti? nke anyị ji enwe ụlọahịa ọbụla ebe anyị kpọwara ahịa? Njikọ Igbo Onyeisi otu ndị Igbo akpọrọ ""Njikọ Igbo"" bụ ụkọchụkwụ Okechukwu Obioha kwuru na onweghị ihe otu ha mere ndị Igbo iche makana ha bụghị ndị na-azụ ahịa nke ha ji abụ otu na-anakọ ego. O kwuru na o ji ego ya nyere ndị enweghị ka ọ ha ha aka. O kwuru na ihe kachasị mkpa ugbua bụ inye ndị Igbo ohere ka ha chịa n'afọ 2023. N'okwu ya, "" ndị Igbo chịa, enyemaka ga-eru ndị Igbo aka ọfụma ma oge dịka coronavirus dakwasa Naịjirịa. Massob Raph Uwazurike bụ onye ndu ndị ""Movement for Emancipation of Soverign State of Biafra"" (Massob) kwuru na ọ gaghị ekwuli okwu n'ekwenti makana ọ maghị onye ya na ya na-akparịta ụka n'agbanyeghị na anyị kọwara ya onye anyị bụ. Anyị na-ele anyị ka anyị mara ma anyị na ya a ga-akpa n'oge na-abịa. Anyị ka na-agbali ka anyị nwete ozi zuru oke n'aka otu Indigenous People of Biafra bụ Ipob n'ichafu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: May Day 2020: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19" afirika-49808584,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49808584,Border closure: 'Gọọmentị agwaghị anyị tupu ha emechie Border' - Ndị na-atụbata ahịa,Ọnụ na-ekwuru ndị 'Association of Nigerian Licence Custom Agents' (ANLCA) bụ Austin Nwosu kwara arịrị sị na mmechị e mechiri oke ala Naịjirịa na Benin Republic bụ oke njọ ahịa dịri ndị otu ha.,"Ọ sị na gọọmentị agbaghịrị ha ama tupu e mechie okeala a nke bụ na ahịa ndị mmadụ bitere ego zụọ ka tọrọ n'ụzọ. Nwosu sị na ya bụ ""Okeala e mechiri n'ọnwa asatọ nke afọ a bịara ha na mberede"". Ọ sị na gọomentị gwara ha na ọ bụ ama a gbaara ha maka ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bubata ahịa iwu mere ha ji mechie ya bụ okeala. Austin Nwosu bụ PRO ndị Association of Nigeria Licensed Customs Agent (ANLCA) Seme Chapter nakwa Odeakwụkwọ ndị Steering Committee of the Federation of ECOWAS Licensed Customs Brokers Nwosu sị na ha jụrụ ha ihe ngwaahịa ndị ezigbo mmadụ so ụzọ ahụ ga-eme? Ndị ọrụ nchekwa ahụ sị ha na-arụ ọrụ gọọmentị dịka e sị zie ha. ""na onweghi ihe ha ga-eme"". Ọ sị na ọ rara ahụ i si mba Benin Republic bụbata ngwaahịa ugbua. Ụgbọala bụ ngwaahịa na Seme Bọda O kwuru na ibu ọtụtụ mmadụ bitere ego n'ụlọakụ bụ nke na-amụwabanye ruru naịra iri na asatọ kwa ụbọchị maka ụgbọala bu ibu. Ọ sịkwa na ndị ekperima na-ezukwa ọtụtụ ngwaahịa ụmụigbo nọ n'ụzọ ebe ahụ. Nwosu sị na mmechi a emetutachaghị ahịa osikapa maka na ọ bụ ahịa iwu kamgbe. N'olu ya, ""ọ bụghị ụzọ ahụ ka ha na-esi aga"". Mana o kwukwara na ihe mere osikapa ofesi ji aga ahịa bụ maka na nke akọrọ na Naịjirịa ka adala ọnụ. Nwosu na-arịọ ndị gọọmentị ka ha kawa ahụ mee ka ezigbo ahịa na-abata na Naịjirịa ma 'ghara itufu nwata na mmri e ji saa ya ahụ'. Ihe nkiri ga-amasị gị Onye na-akọ osikapa Abakaliki Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51067550,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51067550,"Bottled Leopard: Chukwuemeka Ike, onye na-ede akwụkwọ a ma ama, anwụọla",Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Chukwuemeka Ike anwụọla.,"Ọ nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe nke dị na Nnewi. Otu onye ma maka ọnwụ Igwe Ike sị na ""ọ nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị dịka ọ rịara ọrịa obele oge."" Ọ sị na dịka ọ bụ Eze, akpọbeghị okwu ọnwụ ya aha kpọm kwem. Chukwuemeka Ike bụ Igwe na-achị Ndikelionwu dị n'okpuruọchịchị Orumba North n'Anambara steeti. Akwụkwọ e ji mara ya bụ Bottled Leopard nakwa ndị ọzọ. Ihe ise ị maghị maka Chukwuemeka Ike - Ọ mụtara nanị otu nwa aha ya bụ Osita Ike mana ọ nwụọla. - Ọ lụrụ onye Yoruba bụ Ọkammụta Adebimpe Ike. - Ọ bụ Eze Ndikelionwu dị n'Anambra steeti dịka nna mụrụ ya siri bụ - Ọ bụ ya mere ka a na-akpọ ị ghọ aghụghgọ n'ule ""Expo"" site n'akwụkwọ o dere maka ya a kpọrọ ""Expo 77"" Ndị mmadụ na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP bụ Atiku Abubakar si ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa Uzochukwu Nkamuke kwuru etu na ọnwụ Igwe Ike wutere ya Michael Chiedoziem kwuru na ọ bụ odogwu n'odeeakwụkwọ Chioma kwuru na akwụkwọ ya Bottled Leopard bụ akwụkwọ kachasị masị ya Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45555447,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45555447,ADF na ndi Igbo bi na Chicago etiela aka n'ala maka nnwereonwe Igbo,"Ndigbo bi na Chicago dị na mba Amerịka akwadola mkpebi ogbakọ ndigbo mere n'Enugwu n'ọnwa Julaị afọ 2018, nke Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ya bụ mkpebi bụ ike otu onye na ya ekwenyeghị na ya.","Chief Friday Nwokoma Onwukwe (Onyeisi ndị Igbo na Chicago); Chief Eddie Nwosu (Onye nchịkọta ọgbakọ a); Ọkammụta Uzodinma Nwala (Onyeisi ADF) na ndị ọzọ Ndị otu a kwuru ihe a mgbe ha nabatara ndị isi Alaigbo Development Foundation (ADF) bụ Ọkammụta Uzodinma Nwala, so na ndị gara njem mkparịtaụka na mba ahụ na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke Septemba, 2018. Onye nchịkọta ADF gụpụtaara ndị Igbo bị na Chicago ihe dị na mkpebi ọgbakọ ahụ e mere n'Enugwu bụ nke otu dị iche iche na-akwado nnwereonwe na ọdịmma ndigbo ma nke ha binyekwara aka n'Anambara steeti. N'okwu ya, Nwala sị na isiokwu ndigbo gbara mkpị abụọ. Mbụ, ụfọdụ ndịgbo kwenyere na ọ ga-akara ndigbo mma ịnọrọ na Naịjirịa n'olileanya na echi ga-aka mma. Ndị otu nkwenye a na-ekwukwa na ọ dị mma ndị Igbo na ndị agbụrụ ọbụla nọ na Naịjirịa ịkwụrụ onwe ha ma kwekọrịta ma ha achọrọ ịnọ ka ha achọrọ ịpụ, ma nwekwa ikike ịpụ mgbe ha chọrọ. Nwala rụtụrụ aka na onweghị mgbe ndigbo kwekọrịtara ịnọ na Naịjirịa dịka ndị ọcha siri gbakwunye onye ọbụla isi n'afọ 1914. Ọkamụta Uzodinma Nwala N'ihi ya, ọbụrụ na ndigbo ga-anọ na Naịjirịa, ha ga-enwe ike inwere ala ha, onyinye ọnatarachị ha, nchekwa ha, iwu ha ma nwekwa ohere ha na ndị ọbụla imekọrịta. Nke abụọ, ndigbo ọzọ kwenyere na afọ otu narị na anọ (104) ndigbo tinyere na Naịjirịa bụ ihe efu nke bụ na ndigbo ga-agawara onwe ha. Nke bụ na ọbụrụ na ndị isiabaokpu chọrọ ịkpagbu ndigbo ekweghị na atụmatụ udo niile a ewetere, ihe ga-aka mma bụ ka Igbo gawara onwe ha zawa aha ọbụla dị ha mma. Nwala sị na ""nke a dị n'akwụkwọ ikike ọnatarachi nkwekọrịta nke United Nation nakwa nke ọgbakọ nke mba Afrịka"". Ndigbo bi na Chicago, US Na ngwụcha ọgbakọ a, Igbo Chicago rịọrọ ndị gọọmenti Alaigbo ka ha kwado mbo ADF ma kpọkukwa ndigbo nọ n'ofesi ma ndị nọ n'ụlọ ka ha kwadosie mkpebi ọgbakọ ndigbo mere n'Enugwu nakwa n'Anambara n'agbanyeghị ihe ndị ọchịchị isiabaokpu chọrọ. N'otu aka ahụ, ha katọkwara ma kagbuo etu esiri kpọchie ụmụnwaanyị Igbo bụ ndị mere ngagharị iwe oge gara aga. Ha kpọkwara gọọmenti etiti ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu na Nna ya na Nne nakwa ndị ọzọ e ji eji maka nnwereonwe Biafra. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52050154,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52050154,Coronavirus tips: Lee nka asatọ i nwere ike ịmụta iji nweta ego n'ụwa Coronavirụs a,"Gọọmenti steeti ụfọdụ dịka Rivas,Kogi agbachiela ọpụpụ na mbata na steeti ha, ebe ụfọdụ dịka Legos mechiri ahịa.","Enugwu,Anambara Ebonyi,Imo mechiri ụlọakwụkwọ, ma kwụsịkwa ndị ọrụ oyibo ọrụ dịka ọrịa coronavirus jiderela mmadụ 56 na Naijiria. Ụfọdụ ndị mmadụ tụrụ onwe ha mkpọrọ iji gbalahụ ọrịa a maọbụ kesaa ya ndị ọzọ. Mana ọkụkọ hapụ kwọm, gịnịka ọ ga-eji zụọ ụmụ ya? Onye ọbụla hapụ ịgba mbọ, kedụ ebe opi ga-esi apụtara onye nọ n'ụlọ? Olileanya dị. I nwere ike ị nọ n'ụlọ gị na-amị ego site na ime ihe doro anya ma sikwa ezi. Leekwa ihe ndị i nwere ike ime ugbua iji were na-egbu ego mma n'ụwa Coronavirus a chị ọkụ na amụma ugbua: 1. Etu e si eme 'meatpie Onye ọnụ ụtọ, ama m na ịta achịcha na-amasị gị nke ọma mana ị ma na ịmụta etu e si eme ya nwere ike ime gị ite ego ugbua ọgbọ ọgụ siri ike? Ebe ịmụta ime 'meatpie' ji dị mma bụ na i nwere ike ire na ịntanet. 2.Ka e si eme 'hand sanitizer' Etu e si eme 'hand sanitizer' Mmanu a na-ete n'aka maka mgbochi ọrịa nke a na-akpọ 'handsanitizer na Bekee bụzịkwa 'American visa' ugbua. Otu ekpem 'hand sanitizer' a na-erebu N500 na-adazi N1000 kemgbe ikuku coronavirus kubatara Naijiria. Ọ bụrụ na ịmụta etu e si eme 'hand sanitizer', ọ bụghị naani na ị gaghị na-emefuzi ego, ịzụ ya maka nchekwa gị na-ezianụlọ gị, ị ga-eresi ndị agbataobi gị na ndị ọzọ nọrọ gị nso. 3.Etu e si eme ude Ndị ọkachamara na-eti mkpu maka ọtụtụ kemikal na-emerụ mmadụ ahụ na-adị n'ude ndị ana ere na-ahịa ugbua. I nwere ike ịmụ ka e si eme ude bekee nke iji aka gị zụrụ ngwa e ji eme ya maọbụ ude akị . Udeakị nwere mkpa ahụike dị iche iche ọ na-egbo n'ụmụaka nakwa ndị okenye. Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị 4.Etu e si eke nnukwu ịchafụ (gele) I nwere ike isị na anaghị agazị ụka maọbụ agbamakwụkwọ ugbua, mana iwere ugbua ị nọ n'ụlọ mụta etu e si asụ ịchafụ nke ndị Yoroba na-akpọ 'gele', ị mara n' ị naferela. Ịkwụ n'ihu ugegbe awa kwulu awa tupu ị gaa mmemme ebeela. Ị ga-ana esikwa na ya enweta nchọnchọ ego, wezuga anya n'ụgwọọnwa gị. 5.Etu e si eme ncha nkọta I nwere ike iji oge ezumike mụta etu esi eme ncha nkọta(black soap) e ji asa ahụ. Ugbua ọtụtụ mmadụ naa-alaghachi na ihe ndị dị ka chi si kee ha'organic products' bụ oge ị ga-eji ya kpaa ego. 6.Etu e si eme abacha mmiri Ị mụta eti e si abacha mmiri n'oge oke agụụ a na-eche ga-eso 'lockdown', okwu agwụla. Ị ga-anọ n'ofe. Ịtaghị ya na akị Bekee, ịgwọ ya agwọ maọbụ iresi ndị mmadụ, ụwa ana aga. 7.Etu e si eji ịntanet akpata ego I nwere ike ịmụta etu e si na-ede 'blog' banyere ihe ị bụ ọkaibe na ya; etu ire ahịa n' ịntanet, ime websait, mgbasaozi ahịa n'ịntanet 8.Etu esi eme achichia bekee(cake) 9. Mụta asụsụ ọhụrụ Ugbua a nọ n'agbọ 'Information technology', o nweghị ihe ị nweghị ike ịmụta gụnyere ịmụta asụsụ ọhụrụ. Ihe o ji kacha mma ugbua bụ na ọ dịghị mkpa na ị ga-agara ya ụlọakwụkwọ. Naanị chọọ ụzọ ya n'ịntanet. Ị mụta asụsụ dịka Frenchị, Mandarin wdg ga-abara gị uru n'ihi na i nwere ike ịghọ onye nkuzi asụsụ ahụ ma ji ya akpata ego ma ị mụta ya nke ọma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48090158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48090158,National Assembly: Ndị Igbo akwụọla ụgwọ kwesiri inye ha oke ha n'ụlọomeiwu - Sịnetọ Adighije,Ndị isi okpokpo nọ n'APC nke Abia Steeti mere nzuko ma kwekọrịta ịkwado Orji Uzor Kalu na Nkiru Onyejeocha ịzọ ọkwa n'ụlọomeiwu Naịjirịa.,"Nzukọ a bụ nke ha mere n'ụlọ Orji Uzor Kalu dị n'Igbere Abia State ka ha nọ kwado Kalu n'ịzọ ọkwa dịka Osote onyeisi sịnetị na Onyejeocha n'ịzọ ọkwa onyeisi ụlọ nnọchite anya. Onye kachiri okwu na nkwekọrịta a bụ onyeisi ime obi pati APC nakwa sịnetọ nọchiburu anya Abia Central bụ Chris Adighije. N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, sịnetọ Chris Adighije kwuru na ihe mere ha jiri mee nke a bụ ka Ndigbo soro keta oke n'ọchịchị a dịka mpaghara ndị ọzọ na Naịjiria. O kwuru na ebe ọ bụ na onyeisiala si na mpaghara Ugwu, osote ya si na Ọdịda-Anyanwụ na o kwesịrị ka Ndigbo họpụta onyeisi Sinetị ma ọ bụ osote onyeisi Sineti nakwa onyeisi ụlọnnọchite anya. O gara n'ihu kwuo na "" Ndigbo akwụọla ụgwọ ha site n'ịchụ aja n'agha a lụrụ oge gara aga, ekwesiri inye ha ihe ruru ha"". Adighije kwuru na mmadụ abụọ a ha na-akwado bụ Orji Uzor Kalu na Nkiru Onyejeocha bụ ndị katara ahụ maara nke egwu na-akụ n'Ụlọomeiwu Naịjirịa. Cheta na Orji Uzor Kalu bụbu gọvanọ Abia Steeti nwetara mmeri ntuliaka afọ 2019 ịnọchite anya mpaghara Abia-North n'Ụlọomeiwu dịka onye Sịnetọ. Ebe Nkiru Onyejeocha nwetara mmeri ịnọchite anya mpaghara Isuikwuato/Umunneochi nke ugboro anọ n'Ụlọomeiwu dịka onyennọchiteanya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48249140,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48249140,Nse Ikpe Etim: Ihe mere o ji wepụ akpa nwa ya,Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ ọgwụ n'elu isi na-awa ndị ọzọ?,"Ọ bụ ajụjụ a mere onye ama ama na-eme ihe nkiri bụ Nse Ikpe Etim ka ọ kọwapụta etu ndị mmadụ si na-agbadoro ya ọkụ n'akpa nwa ya. N'ime mkparịtaụka o nwere nso nso akpọrọ "" conversations with Nse"", ọ gwara ndị mmadụ na ụmụnwaanyị na-amutabeghị nwa na-agabiga ọtụtụ ihe n'aka ụwa. Ọ sị ""ọtụtụ na-eche na nwaanyị na-amụtaghị nwa abụghị nwaanyị."" ""N'etiti ịdị ndụ na ịmụta nwa , a họrọla m ịdị ndụ ya mere m ji wepụ akpa nwa m na-enye m nsogbu"" ""Ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ maka na m bụ onye na-agba n'iro mere m ji na-amụtaghị nwa."" Ọ bụghị eziokwu. Nse kwuru na ihe ndị a niile ndị mmadụ boro ya mere ka obi ya daa mba mana ugbua o fụkerela. Ndụmọdụ ọ na-enye ụmụnwaanyị bụ ka ha hụ onwe ha n'anya ma mee ihe dịmma masịrị ha ghara ị na-ele ndị mmadụ anya n'ihu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-51556951,https://www.bbc.com/igbo/media-51556951,Bayelsa State: Ihe mere onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa jiri gbaa arụkwaghịm,Onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa steeti bụ Monday Bubou-Obolo agbaala arụkwaghịm.,"Ndị ụlọomeiwu Bayelsa n'afọ 2005 Osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Abhraham Ngobere ewerela ọchịchị ugbua. Nke a na-abịa dịka e duchara Duoye Diri dịka gọvanọ steeti ahụ. Akụkọ na-ekwu na Bubou-Obolo rituru n'ọkwa ya n'ihi na ya na Diri si n'otu mpaghara steeti ahụ pụta. Cheta na ọ bụ ụlọikpe kachasị mere Diri gọvanọ dịka ha kagbuchara mmeri David Lyon nke pati All Progressives Congress. Ndị uweojii akwụsịla ngagharịiwe ahụ ndị mmadụ chọrọ ime maka ebubo ana ebo nwa T. A. Orji na nwa ya bụ Chinedu Orji n'Abia steeti Mana anyị nụkwara na ngagharịiwe a nke a sị bụ ka a chụtuo Chinedu Orji n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti ga aga n'ihu n'Abuja. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara ndị ntaakụkọ na ha enwetebeghi akwụkwọ ndị na-akwado ya bụ ngagharịiwe. Mgbe onye ntaakụkọ gwara ya na ndị isi ndị uweojii enwetalarị akwụkwọ nke ha n'Abuja ma nyekwa ikike ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu. Ogbonna zara na ha enwetebeghị ntụziaka ndị isi ha gbasara ya bụ ngagharịiwe nke mere na ha agaghị ekwe ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu n'Abia steeti. Lassa fever abatala Legọs Ọrịa lasa fiva (Lassa Fever) dịka ka ọ bụ ndị ọrụ ahụike ka ọchere aka mgba Gọọmentị Legọs Steeti ekwuola na ọrịa ịba Lassa abatala na Steeti ha. Kọmishọna ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi kwuru na onye bu ọrịa a nọzị n'ụsọ ebe ọ gaghị emetu ndị ọzọ ahụ n'ụlọọgwụ LUTH. Ahịhịa dị na udu mmanụ ụgbọelu A hụrụ ahịhịa n'ime udu mmanụ ụgbọelu a kpọrọ fuel tank n'ụgbọelu Boeing 737 Max be nke a rụrụ ọhụrụ. Onye isiụlọọrụ Ụgbọelu Boeing sị na ọ maghị ka mmiri si banye n'opi ụgbọghịrị ma gbarụọ ihu kwuo na ha agaghị anabata ụdị ihe ahụ n'ọrụ ha. N'egwuregwu N'egwuregwu Deontay Wilder aṅụọla iyi na ọ ga-abụ ọkaibe n'iti ọkpọ dị ka Muhammad Ali ma ya lụọ ọgụ nchekwa nturu ugo ya nke ụgbọrọ iri na otu. Wilder kwuru nke a dịka ọ na-akwado ọkpọ nke ya na Tyson Fury ga-akụ n'ụbọchị Satọde. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Nwa onyeisiala Naịjirịa bụ Fatima Buhari mere njem mberede na Federal Polytechnic Nekede, Owerri, ụbọchị Monde. Ya bụ nwaada gara njem nleta na ya bụ ụlọakwụkwọ ekwughị ihe ọbụla ka o ruru ebe ahụ. Mana dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Ever Nwosu siri kwuo, ""ihe ụlọakwụkwọ anyị na-amasị ya"". Nwosi sị na Fatima gara leta ọtụtụ iche iche ebe dịka ngalaba na-amụ maka ahụike. Mgbe BBC jụrụ ya ihe nwere ike ibute mmasị nwaagbọghọ a n'ụlọakwụkwọ ha, Nwosu sị na ya enweghị ike ịkọwa mana ụlọakwụkwọ ha nọ n'isi ụlọakwụkwọ ndị nka na ụzụ na Naịjirịa dịka ndị National Board for Technical Education (NBTC) si kwuo. O kwukwara na ọ bụ Federal Polytechnic Nekede bụ Mahadum nka na ụzụ akacha achọ na ụle Jamb dịka ndị ụlọọrụ ahụ siri kwuo. Nwosu sị na ọ ga-abụ ihe ndị a mere anya onye ọbụla ji dị na ya bụ ụlọakwụkwọ. Okwukwara na-onweghị ihe ụlọakwụkwọ ahụ rịọrọ ya mana atụrụ anya na ọ nwere ike ịgwa ndị isi ihe ọ hụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ na njem ya. Ndị omekome awakpola obodo ọzọ na Borno steeti Ogbunigwe so na ihe ndị Boko Haram jị ebuso Naịjirịa agha Na tuzdei ka ndị ekperima a wakporo Kwarangulum na Ntsiha bụ obodo abụọ nọketere Chibok. Ọnụ na-ekwuru otu obodo ọzọ nọketere ebe ahụ bụ Allen Manasseh kwuru na-agbakwuru ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo ndị ahụ dị na Borno steeti. Boss Mustapha ekwuola uche ya Ndị isi ọchịchị gọọmenti etiti ekwuola na ịchutu ndị isi ọrụnchekwa na mberede ga-emebi ihe na Naịjirịa. Ọ bụ odeakwukwo ukwu gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha kwuru nke a n'emume ndị otu Christain Association of Naịjirịa mere. Ndị eji eji na Japan enwerela onwe ha Ọzịọma pụtara na Japan n'ụtụtụ Wenezde a na-egosi na onye mbụ agbala ụkwụ n'ala site n'ọgbọmmiri Diamond Princess eji eji izuuka abụọ maka nnyọcha Coronavirus. Nnyocha gosiri na mmadụ narị ise, iri anọ na abụọ butere ya bụ ọrịa n'ụgbọmmiri ahụ a na-ekpori ndụ n'ime ha. Uefa Campions league N'egwuruegwu agbara ụnyahụ Atlatico Madrid gbara Liverpool otu ọkpụ. N'aka ọzọ, Borisia Dortmund ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Paris St. Germane. Gee akụkọ ndị a na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45205286,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45205286,"Carbon Monoxide: Tupu i gbanye igwe i ji amụ ọkụ, lee etu ị ga-esi chekwaa onwe gị","Kwa ụbọchị ka akụkọ na-apụta etu gaasị Bekee kpọrọ ""Carbon Monoxide"" si egbu ndị mmadụ n'ụra.","Ọtụtụ ndị mmadụ na-amụkarị igwe na-enye ọkụ maka na ọkụ anaghị adịkebe na Naịjirịa Gaasị a na-esi n'igwe na-enye ọkụ enweghị usi nke o ji enwe agwa ""color"", nke mere na ị nwereike ikuru ya na-amaghị ama. BBC Igbo kpọrọ Dọkịta McGinger Ibeneme, onye kwuru na ọ bụ ikuru ọtụtụ 'Carbon Monoxide' a ga-egbunwu mmadụ. O kwukwara na ihe kacha ebute ya bụ nsogbu bụ mmadụ ịnọ ebe ikuku anaghị esinwu apụ, nke bụ na gaasị ọjọọ a bata n'ebe ị nọ, ma ọ hụghị ụzọ ọ ga-esi pụọ, ọ bụrụ nsogbu nye onye na-ekuru ya. BBC Igbo gbara onye ọrụ nchekwa ajụjụọnụ maka egwu dị n'iji igwe ọkụ na-amụ ọkụ nakwa nchekwa dị mkpa maka ya. Dibia Bekee Chuka Agunwa gwara BBC Igbo na egwu dị icheiche dị n'iji igwe ọkụ mụọ ọkụ ọkachasị egwu ọkụ ọgbụgba nakwa egwu anwụrụ ikwugbu mmadụ. Nchekwa megide igwe na-enye ọkụ Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ihe a Mmadụ ise si n'otu ezinaụlọ dị mmadụ isii n'obodo Igboetche dị n'okpuru ọchịchị Etche dị na Rivas steeti anwụọla site n'anwụrụ ọkụ. Ụdị anwụrụ gburu ezinaụlọ ahụ bụ nke si n'igwe na-enye ọkụ nke a na-akpọ 'Genereator' na Bekee. Ndị nwụrụ n'ime ezinaụlọ ahụ bụ nne bụ Onyinye Monye, nna bụ Andrew Monye na ụmụaka atọ n'ime anọ. Akụkọ kwuru na ezinaụlọ ahụ gbanyere igwe ahụ na-enye ọkụ ahụ dobe ya n'ime ụlọ ebe ha na-asa ahụ were labaa ụra. Mana ndị ọrụ nchekwa na ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na anwụrụ si n'igwe ahụ enweghị ebe o si apụ, kama ọ bara n'ime ụlọ niile wee tọgbuo mmadụ ise ahụ n'ụra. Naanị otu onye ka a gbapụtara n'ime ha bụ otu nwa ha dị afọ 13 bụ onye e bugara ụlọọgwụ mana ụmụnne ya ndị ọzọ dị afọ 15 na afọ 11 nwụrụ n'ụra ha. Otu onye obodo ahụ kwuru n'igwe ahụ na anọbu na mbara mana ọ bụ ohi e bidoro na-ezu n'akụkụ ebe ahụ mere ha ji bubaa ya n'ime ụlọ. Mana ụfọdụ ndị ezinaụlọ ahụ ekwetaghị n'ihe a mere, kama, ha na-ekwu na ọ bụ nshi ka e nyere ụmụnne ha. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni kwuru n'ezie n'ihe a mere, ebe e bugara ozu mmadụ ise ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu. O kwukwara na ha na-eme nyocha banyere ihe ahụ mere. Ọtụtụ ezinaụlọ na-eji igwe na-enye ọkụ amụ ọkụ na naịjirịa nke mere na ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara nchekwa dị icheiche igbochi ọkụ maọbụ anwụrụ si na igwe ahụ. Dr. Chuka Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" 44279020,https://www.bbc.com/igbo/44279020,Onye Mali rigoro ụlọelu ịzọ nwata abụrụla onye France,Otu onye Mali gbagara ọsọ ndụ na France abụrụla onye a na-akpọ dike maka etu o siri gba mbọ zọpụta nwata dị afọ anọ chọbụrụ ị dapụ n'elu ụlọelu.,"Gassama na Macron zụkọrọ taa N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala France bụ Emmanuel Macron emela nwoke ahụ a kpọrọ Mamoudu Gassama onye France, ma nye ya akwụkwọ ikike. Mamoudou Gassama nwetara ekele nke ukwuu etu o siri ria ilu uloelu ahụ ga zopụta nwata ahu chọrọ ị dapụ. Onyonmyo siri France gosiri ebe ọ na arị ụlọ elu ahụ nakwa ndị mmadụ na-eti mkpu ha ji agba ya ume. Ka onyeisiala Emmanuel Macron zutere ya n'obi ukwu ndị France akpọrọ Elysee Palace, okwuru na Gassam ga abụrụzi onye France. Ọ gakwara n'ihu nye Gassama ezigbo ekele, ma nye ya ọlaedo ma kwukwa na a ga enye ya ọrụ n'ụlọ ịgbanyụ ọkụ. Oku mberede a Gassama zara mere n'isi obodo France bụ Paris, n'ehihe ụbọchị 27 ọnwa a bụ Mee. Gassam zikọrọ akwụkị̀ọ ikike enyere ya Maazi Gassama kwuru na ọ na-agafe were hụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ ahụ. ""Ka m kutere nwa ahụ n'aka m, ajụrụ m ya ihe mere o jiri me ihe a omere, mana ọ zaghị m,"" Gassama kwuru. Ndị ọlụ mgbanyụ ọkụ Paris kwuru na mgbe ha rụrụ ebeahụ, ha hụrụ na a zọpụtara onye nọ na nsogbu. Akụkọ Maazị Gassama dị ka ihe onye Mali ọzọ a kpọrọ Lassana Bathily mere n'afọ 2015 mgbe ndị oyi egwu wakporo ebe a na-ere nrị. Maazi Bathily nyere mmadụ isii aka di ka ọ kpọrọ ha gaa ebe ha zoro ma rịpụ ga kpọ ndị uweojii. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 56245385,https://www.bbc.com/igbo/56245385,Epilepsy Meaning: Etu ị ga-esi nyere onye nwere akwụkwụ aka,"Akwụkwụ, nke bekee kpọrọ 'epilepsy', bụ otu ọnọdụ ahụike a na-ahụta ka ihe arụ n'omenala Igbo.","Etu ya bụ ihe si egosipụta onwe ya n'ahụ mmadụ bụ site n'ihe ọdịdọ nke bekee kpọrọ 'seizures'. Ihe ọdịdọ bụ mgbe ahụ mmadụ malitere ịma jijiji n'otu ntabi anya, onye ahụ agaghị enwetakwa onwe ya, o nwere ike daa n'ala, o nwekwara ike ọfụfụ esi ya n'ọnụ na-apụta. Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-agbara onye nwere ụdị ọnọdụ a ọsọ ma na-asọkwa ya asọ. Nke a jọgburu onwe ya. Ọzọkwa bụ na enwere ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara mmadụ ihe ọdịdọ. Ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara mmadụ ihe ọdịdọ: Adịmiche n'etiti ọrịa akwụkwụ na ihe ọdịdọ ndị ọzọ Adedoyinsola Oseni, onyeisi otu 'Mary Special Needs Foundation', kwuru na onweghị nnukwu ndịiche n'etiti ihe ọdịdọ nke ọrịa akwụkwụ kpatara na ihe ọdịdọ ndị ọzọ. ""Ma ndị dọkịta bụ ọkachamara, ọ gaghị adịchara ha mfe ikwu ihe di iche ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ mee nnyocha miri emi,"" Oriaku Oseni dere n'akwụkwọ ya. Na webụsaịtị nke ụlọọgwụ 'Cleveland Clinic' na mba Amerịka, ha kọwara na ihe ọdịdọ nkịtị a kpọrọ 'Non-Epileptic Seizures' na-eyite ihe ọdịdọ nke akwụkwụ na-akpata. ""Naanị ndịịche dị na ha bụ ihe na-akpata ha. Ihe ọdịdọ akwụkwụ bụ n'ụbụrụ mmadụ ka ọ na-ebido, mana ihe ọdịdọ ndị ọzọ abụghị n'ụbụrụ ka ha na-ebido."" Ihe kacha mkpa Ọ bụghị ajọ mmụọ maọbụ ọgwụ agwọrọ agwọ na-akpata Ọtụtụ ndị ọkachamara ahụike ekwuola na akwụkwụ abụghị ọrịa n'onwe ya. N'akwụkwọ 'Epilepsy Handbook' nke ụlọọrụ Mary Special Needs Foundation bipụtara, dọkịta Seyi Roberts dere sị: ""Akwụkwụ dị nnọọ ka ọnọdụ ahụike ndị ọzọ siri ike dịka ọbara mgbalielu (Hypertension), ọrịa shuga (Diabetes) maọbụ asthma."" N'ihi nke a, ọ dị mkpa ka ị mata na: Etu ị ga-esi nyere onye na-enwere ọdịdọ aka Mee ka onye ahụ dinara ala n'akụkụ ya ka o nwee ike ị na-ekute ume" akuko-ndi-ozo-42989062,https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-42989062,"N'Oyo Steeti, egbuola onyeisi SARS",Ndị ọchị ehi egbuola onyeisi otu ndị uweojii na-ahụ maka imegide ndị oji egbe ezu ohi akpọrọ SARS n'aha ịchafụ.,"Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Nke a mere oge ya na ndị otu ya na-achọ inapụ ndị ọchị ehi ngwa ọgụ ha ji mgbe ha wakporo ndị ọrụ ugbo na Shaki dị n' Ọyọ steeti. Akụkọ na-ekwu na ndị uweojii a nwụtara kepukepu na ndị ọchị ehi nọ na Oyo na-eyi ndị bi ebe ahụ egwu ma na-awakpo ụmụnwaanyị ha. Ndị ọchị ehi ahụ bidoro gbawa ndị uweojii ahụ egbe nke gbagburu onyeisi SARS akpọrọ Sheu Magu. Otu onye hụrụ ka osi me kwuru na ndị na-achị ehi iwakpo nwaanyị na izu ndị mmadụ ohi abụghị ihe ọhụrụ n'ogbe ahụ. O kwukwara ndị ọchị ehi Bororo na-arụ arụmana a kemgbe;ha na-ejị egbe ha echekwa ehi ha n'oge ehihie ma were ya gbuo ndị mmadụ n'abalị. Mana ọ bụ ọnwụ Magu mere nsogbụ a jịrị pụta ihe. O mere ka ọ meghị? Mgbe BBC gbara onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Oyo bụ Adekunle Ajisebutu,ajụjụ, o kwetere n'ihe mberede a mere na Shaki tara isi onye otu ha. O sị na ha anwụchiela mmadụ anọ echere nọ ọ bụ ha kpara mkpamkpa a. ""Anyị na-enyocha ya bụ ihe.""" egwuregwu-49514772,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49514772,Champions League group stage draw: Onye ga-adabanye n'ọnụ agụ na nke afọ a?,"Dịka a ga-ahọpụtara ndị a ga-enye nturuugo maka etu ha si gbaa n'afọ gara aga, a họpụtala ndị ga-ezute ibe nagba nke mbụ na nke afọ a.","Ndị dịka Manchester City na Shaktar Donetsk zutekwara ọzọ n'afọ a, dịka ha zutere n'afọ gara aga, ebe Liverpool na Napoli zutekwara onwe ha ọzọ. A họpụtara Virgil Van Dijk dịka nwoke kacha gbaa n'asọmpi Champions League nke afọ 2018/2019. Ọ gbawara Lionel Messi na Cristiano Ronaldo etitkọtara ha atọ aka, napụ ha ihe nrite nke a. Ndị ga-ezute ibe N'otu A PSG REAL MADRID CLUB BRUGGE GALATASARAY N'otu B BAYERN MUNICH TOTTENHAM OLYMPIAKOS CREVNA ZVEZDA N'otu C MANCHESTER CITY SHAKTAR DONETSK DINAMO ZAGREB ATALANTA FC N'otu D JUVENTUS ATHLETICO MADRID BAYER LEVERKUSEN LOKOMOTIV MOSCOW N'otu E LIVERPOOL NAPOLI FC SALZBURG GENK N'otu F BARCELONA BORUSSIA DORTMUND INTER MILAN SLAVIA PRAHA N'otu G ZENIT ST PETERSBURG BENFICA OLYMPIQUE LYONNAISE RB LEIPZIG N'otu H CHELSEA AJAX VALENCIA LILLE A họpụtara Lionel Messi dịka ọkacha agba n'ihu nke asọmpi Champions League nke afọ 2018/2019. A họpụtara Frenkie De Jong nke Ajax dịka onye egwu etiti kacha gbaa n'afọ 2018/2019. A họpụtara Virgil Van Dijk nke Liverpool dịka oji azụ kacha gbaa n'afọ 2018/2019. A họpụtara Alisson Becker bụ oche goolu nke Liverpool dịka ""aka kacha chee goolu na Champions League 2018/2019"". Ndị na-akwado Chelsea, Tottenham, Liverpool, Manchester City, Real Madrid, Barcelona, Juventus nakwa otu egwuregwu ndị ọzọ chị obi n'aka. Ha nọ na-eche ịnụ otu ebe ha ga-adabanye ma a malite nhọpụta otu ndị ga-anọ n'agba nke mbụ nke Champions League nke afọ 2019/2020. E tinyere otu ndị a n'ite n'ite, ebe e si họpụta ndị ga-ezute ibe. Otu ndị ọzọ dịka Bayern Munich, Juventus, Borussia Dortmund, Atletico Madrid nakwa Paris Saint Germain (PSG), bụkwa kpọkịrịkpọ ndị nwereike inye ndị mmadụ ọbara mgbalielu. Dịka Liverpool bụ ndị buliri iko asọmpi a n'afọ 2018/2019, ndị ọbụla ga-abanye n'otu ha nwereike ịga banye 'chaplet' ha na mmiri. Ndị nwere agba dịka Cristiano Ronaldo, Lionel Messi nakwa Virgil Van Dijk bụ ndị a họpụtara maka inye nturuugo, wụchikwara ebe ahụ. Emume a mere na Monaco dị na mba Frans. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Tottenham vs Liverpool: Kedụ nnụnnụ a ga-agbaji nku ya?" 45307331,https://www.bbc.com/igbo/45307331,Ị hụla di na nwunye na-amụtaghị nwa n'ihi 'amaghị eme'?,Di na nwunye ndị mba China na-achọ nwa gara ịhụ dibịa bekee maka ọnọdụ amụtaghị nwa nke merela afọ anọ nna agbanyeghị na ha na-emekọ kwa oge.,"Mana nchọpụta ọkammụta n'ihe gbasara ịmụ nwa, a kpọrọ Liu Hongmei mere gosdsiri na dị na nwunye ahụ amaghị eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Dike akwụkwọ akụkọ Newsweek siri dee, dibia bekee ahụ sị, "" Di na nwunye ka nọ na ntorobịa; nwoke dị afọ 26, nwaanyị dị 24. Ha nwere ahụike mana na agbanyeghị na ha alụrụ afọ anọ, ha amụtaghị nwa."" Mpụtara nyocha ahụ abụghị ihe a tụrụ anya. Liu chọpụtara na mmadụ abụọ sị otele nsị emekọ, hapụ ahụ nwaanyị. Nwaany i ahụ kwetara n'ahụ na-afụ ya fụ ma ya na di ya nọkọọ. Liu, dịka ụlọakụkọ ahụ siri kọwa, nyere ha akwụkwọ na-akụsị etu esi emekọ, nwaanyị ahụ tụrụ ime ka ọnwa anọ gachara.""Afọ anọ ka di na nwunye lụrụ, nwoke amaghị eme nke nwanyị na-ama enwe mmekọ. Na China anaghị emepe ọnụ ekwu okwu gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Akụkọ ga-amasị gị:" media-45481556,https://www.bbc.com/igbo/media-45481556,"Kedu ihe mere mmadụ 800,000 ji egbu onwe ha kwa afọ?","Ọgbakọ na-echekwa ahụ ike na mba ụwa niile bụ World Health Organistion ekwuola na mmadụ ruru nari puku asatọ (800,000) bụ ndị na-egbu onweha kwa afọ.","Gịnị butere udị emume a? Ha kwukwara na ihe a bụtere ọnwụ n'etiti ndị mmadụ dị afọ iri na ise ruo afọ iri abụọ na itoolu n'afọ 2016. Ha kwuru nke a n'ime akwụkwọ ha zipuru maka ncheta ụbọchị ịkwụsị ogbugbu onwe nke akporọ World Suicide Prevention Day na bekee. Ha kwuru na ihe ndị mmadụ kachasị egbu onwe ha bụ ịkwụụdọ nakwa iji egbe gbagbuo onwe ha. Ha kwusiri ike na ihe a na-emetuta onyeọbụla ma ọganyara maọbụ ogbenye. Ndị na-aṅụ ọgwụ ike nwere ike igbu onwe ha WHO kwukwara na ọ bụ ndị mba ndị aka adịchaghị n'ego na-enwe ndị kachasị egbu onwe ha. N'ime nyocha ha mere, ha chọpụtara na otu mmadụ na-egbu onwe ha na nkeji iri anọ ọbụna. Nakwa na mmadụ ruru iri na ise na-anwa igbu onwe ha n'ise ụbọchị niile. WHO dọrọ onyeọbụla na ṅụ nnukwu mmanya nakwa ndị na aṅụ ọgwụ ike aka na ntị makana ọ bụ omume a na-ebute echiche igbu onwe. Omenala Igbo Ogbugbu onwe bụ arụ n'ọtụtụ omenala dị icheiche gunyere Alaigbo, mana ọtụtụ ndị ntorobia ka na-egbu onwe ha na steeti dị icheiche gunyere Alaigbo. WHO na-ekwu na makana ogbugbu onwe bụ arụ na ndị nwere echiche ịgbu onwe ha anaghị achọ ikwupute okwu maọbụ gwa ezinụlọ ha nsogbu ha. Ha kwukwara na ruo ugbua sọọsọ mba ruru iri atọ na asatọ mere ịkwụsị ogbugbu onwe ihe di ezigbo mkpa n'ala ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50415969,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50415969,Iva Valley Massacre: Ihe mere ndị na-egwu coal n'Enugu afọ 70 gara aga,Abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ọbụla bụ ụbọchị ncheta ogbugbu e gburu ndịọrụ 'coal' n'Enugwu.,"Ya bụ ihe mere n'afọ 1949. Afọ a mere ya afọ iri asaa o ji mee. 'Iva Valley Massacre'? Nwaeze mba Ingland Philip, mgbe ọ bịara njem nleta n'Iva Valley na Febụwarị 1956. N'oge ndị ọcha mba Briten na-achị Naịjirịa, 'Coal' so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego. Otu n'ime ebe a na-egwupụta coal n'Enugu oge ahụ bụ ebe a kpọrọ 'Iva Mines'. Na Nọvemba 1, 1949, ndịọrụ gbara abụbụ ọrụ n'ihi ụgwọ ndị ọcha ji ha. Kama ịkwụ ha ụgwọ ha, ndị ọcha nyere iwu ka e wepu ogbunigwe niile e ji arụ ọrụ ngwupụta coal na 'Iva Valley'. Ndịọrụ ngwupụta 'coal' na Iva Valley Mana ndịọrụ ahụ ekweghị ka e wepụ ihe ndị ahụ. Ha ma na ndị ọcha ga-emechi ebe ahụ ma ha wepụchaa ogbunigwe ndị ahụ. Mgbe nke a na-eme, onyeisi ndị uweojii aha ya bụ F.S Philip nyere ndị otu ya iwu ka ha were egbe chụsasịa ndịọrụ ahụ. Ndịọrụ mmadụ iri abụọ na otu nakwa otu onye na-agara onwe ya nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara. Ndị nwụrụ n'Ịva Valley Aha ụfọdụ ndịọrụ 'coal' nwụrụ na Iva Valley Aha ndịọrụ e gburu na ọgbaaghara 'Iva Valley' ka dị ruo taa. Otu a kpọrọ 'Centre for Memories' nke dị n'Enugwu nyere BBC Igbo ụfọdụ aha ndị a. Ha gunyere: Sunday Anyasodo, Livinus Okechukwuma, William Nwehu, Felix Nnaji, Ogbania Chime na Moses Ikegbu. Ndị ọzọ bụ Okafor Ageni, Augustine Nwokoma, Onoh Onyia, James Ekeowa, Nwachukwu Ugwu, Ngwu Nwafor, Jonathan Ezeani, dgz. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ikike dịịrị onye kwenyere na ọnwụ ndịọrụ 'coal' na Iva Valley bụ ihe nlegara anya nye ndị otu ndịọrụ niile. Coal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" mba-uba-44707839,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44707839,Thailand: Ihe onyonyo ọhụrụ egosila na ahụ siri ụmụaka ụmụnwoke ahụ ike,Ihe onyonyo ọhụrụ agbala nke gosiri ụmụaka ụmụnwoke mmadụ 12 nke otu ọgba bọọlụ Tayiland na onye nkuzi ha nọ n'ọgba mana ahụ siri ha ike.,"Ị ga-ahụ ụmụntakịrị ahụ ebe ha na-agwa onye na-egwu mmiri aha ha Ọchụ juru ụfọsụ n'ime ha ọnụ dịka ha na-ekwupụta aha ha otu na otu. A chọtara ha ụbọchị 2 Julai dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị itoolu a na-acho ma na ha dabara n'ime ọgba ebili mmiri dị ma na a na-ewegara nri na ọgwụ kamgbe ahụ. Otu ihe bụ na mgbapụta ha nwereike iwe ọtụtụ ọnwa maka mmiri ahụ, ụzọ ihe abụọ bụ na e nwereike a kuziere ha etu e si egwu mmiri maọbụ e chere ka mmiri ahụ gbatuo. Ihe nchegbu bụ na mmiri ka bidoro izo ya bụ na mmiri ga na-ebili karịa etu ọ dị ugbua. Ihe onyonyo ndị agha mmiri Tayiland gosiri n'elu Facebook ahụ gosiri ka ụmụaka ahụ yi uwe nchekwa dị fịrịfịrị. Ụmụaka ahụ niile kwuru aha ha ma kelee ekele ndị Tayiland Ụfọdụ ihe onyonyo ndị ọzọ gosiri na ụmụaka ahụ nwere ober ihe mmerụahụ nke ndị agha mmiri letara anya. Ndị mgbapụta na ndị dọkịnta na nọs nonyere ha kamgbe a chọtara ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52577000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52577000,Igbo culture: O nwere ihe dị iche n'etiti omenaala na Ịgọ mmụọ?,"Tupu anyị agbapụ ya ọsọ, ka anyị buru ụzọ kọwaa ihe omenaala pụtara. Dịka ndị ọkachamara siri kọwaa, omenaala bụ ụzọ mba si eme ihe.","Etu ha si eri nri, eyi akwa, agba egwu, alụ nwaanyị, eti mmanwụ na ihe ndị dị icheiche ma gụnyere etu ha si ekpere chi ha nakwa efe ofufe. Omenaala bara ụba nke ukwu ma bụrụ mgbọrọgwụ mba ọbụla ji aba. Ọ bụkwa njirimara na-ekewapụta ha n'ebe mba ọzọ niile dị n'ụwa dị. Ịmaatụ: E jirila uwe ishi agụ we mara ndị Igbo nke pụtara na mba ọzọ ọbụla na Naịjirịa na-ahụ onye yi akwa ishiagụ dịka onye Igbo maọbụ onye chọrọ ikwado ndị Igbo. Isi a hụrụ kwaba okpu maka akụkọ a bụ ndị Igbo, ka anyị tinye anya n'omenaala Igbo. Omenaala Igbo Ọtụtụ omenaala Igbo na-enye obi aṅụrị. Anyị na-edepụta ụfọdụ n'ime ha ebe a: 1. Ịgọ ọfọ Ọfọ na ogu bụ otu ihe ndị Igbo ji aga, ịgọ ọfọ bụ ikpe ekpere. Etu ahụ ka ndị Igbo si ekpere mmadụ ezi ekpere. 2. Egwu Igbo niile na-anabata egwu ogene dịka nke ha. Onye Igbo ọbụla nụrụ ogene na ọja na-enwe ụdị mkpali na-abịa ya n'ahụ. Igbo na-ejikwanụ egwu dị icheiche eme mmemme ma nke a na-agụ agụ ma nke a na-agba agba. Ụfọdụ egwu Igbo na-agba bụ Adamma, atịlọgwụ, egedege wdgz. 3. Mmemme E nwere ọtụtụ mmemme ndị Igbo ji egosipụta omenaala ha, dịka iri ji ọhụụ, ịwa akwa, ito ọgbọ wdgz. 4. Ịlụ nwaanyị Ndị Igbo nwere usoro ha ji alụ nwaanyị. Obodo dị icheiche nwere etu ha si eme nke ha mana otu ihe dị na ha niile bụ na a na-edebe ego e ji alụ nwaanyị. O nwere ebe ndị na-eme ịgbanwkụ nakwa iru mgbede. 5. Ịwaọjị Ndị Igbo bụ ndị na-anabata ndị ọbịa nke ọma, ọ bụ omenaala Igbo ịwara onye ọbịa niile ọjị iji nabata ya. 6. Ibi ugwu Ndị Igbo na-ebikwa nwata nwoke ugwu na mkpụrụ ụbọchị asatọ ka a mụchara ya. 7. Ikuchi nwaanyị na ihachi nwaanyị Nke a bụ ebe nwoke ga-akụchi nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ. Omenaala Igbo karịrị akarị mana ugbua, ka anyị lebaa anya n'okpukperechi ndị Igbo. 8. Mmọnwụ Dịka ndị mba nwere mmọnwụ ha ji akpa ụmụaka obi aṅụrị n'oge ekeresimesi, etu a ka mmanwụ si dị icheiche. Ọ bụghị mmọnwụ Igbo niile bụ nke e ji gọọ mụọ, o nwere ndị ụmụaka ji eme onwe ha obi ụtọ ma ndị e ji enwe aṅụrị. Nke bụ eziokwu bụ na ụfọdụ ụlọụka Katọlik na-eti mmọnwụ ha ji eme ndị ụka ha obi aṅụrị. E jikwa mmọnwụ eme mmemme. A na-akpọta ya ebe a na-eme emume dị icheiche ka ha gbaa egwu maọbụ mee ndị bịara emume obi ụtọ. 9. Nri E ji nri dị icheiche mara ndị Igbo dịka ofe ọha, abacha, ụgba na ndị ọzọ Okpukperechi n'ala Igbo I leghachị anya ebe anyị malitere, anyị kwuru na etu mba si efe ofufe sokwa n'ime omenaala ha, nke a bụkwa eziokwu nye ndị Igbo. N'ala Igbo, e nwere chi dị icheiche dịka ala, amadịọha, chukwu, ọnwa, anyanwụ, ikenga, agwụ, ekwensu dgz Obodo ọbụla nwere nke ha ma nwee ihe ha na-akpọ ya mana Chukwu Okike ka a maara dịka Chukwu kacha chi niile. Chi ndị a nwere arụsị ndị e ji efe ha, ihe a na-akpọ arụsị ndị a dịkwa iche n'obodo ọbụla ị gara. Ife chi ndị ahụ site n'arụsị e ji mara ha bụ okpukperechi ndị Igbo ma bụrụkwa naanị nke ha na-eme tupu ụka abịa. Nke bụ eziokwu bụ na ezinaụlọ niile nwere chi nke ha nwee arụsị nke ha. Usoro ikpere arụsị ndị ahụ dị icheiche bụ ihe Igbo mara dịka ịgọ mmụọ. Kama na dịka ịgọ ọfọ bụ ikpe ekpere ọma, ịgọ mmụọ bụ ikpere arụsị na chi ha. Ihe e ji agọ mmụọ dịka igbu ọkụkọ wụsa ọbara ya, ịgba aja na ụfọdụ ihe ndị ọzọ bụ ihe mere na ọtụtụ ndị Igbo anabataghizi ya gụnyere na ụka bịara. Ịgọ mmụọ gosiri na okpukperechi bụ naanị otu n'ime omenaala Igbo nke bụ na ọ bụghị mmadụ niile na-emezi ya ugbua. Ọtụtụ ndị Igbo na-agazị ụka, ha anaghịzi agọ mmụọ. Nke a ọ pụtaziri na ha agaghị esonye gbaa egwu ogene maọbụ bie nwa ha ugwu maọbụ gọọrọ nwa ha ọfọ? Azịza ajụjụ a bụ mba! makana omenaala ndị a abụghị okpukpere ịgọ mmụọ. Ọ pụtara na onye Igbo na-aga ụka nwereike ịwa ọjị maọbụ gọọ ọfọ maọbụ gbaa egwu maọbụ gwọọ abacha ma ọ bụghị onye ọgọ mmụọ kama okpukpere nke ya bụ nke onye Kraịst. . Omenaala Igbo na Ụka Kraịst Onye Igbo ekwesighi iji maka na ọ na-aga ụka tufuo omenaala ya niile bụ ejirimara ya. Onye na-aga ụka ekwesighi ịgọ mmụọ maka na ọ bụ okpukpere abụọ mana e wezuga ịgọ mmụọ, e nwere ọtụtụ omenaala ndị ọzọ e ji mara ndị Igbo dị mma ka e chekwa ya. Otu ụkọchukwu ụka Katọlik bụ Chiadika Okoli kwuru na egwu ọdịnaala Igbo na-enyere ha aka ịgbasa ozioma Kraịst. O kwuru na ha na-eji egwu ogene na ọja eto Chukwu ebe ha na-etikwa mmọnwụ ha ji eme ndị mmaọdụ obi aṅụrị. Ụfọdụ ndị mmadụ ekwuola na ụfọdụ omenaala Igbo adịghị mma ma kwesi ka a kwụsị ya kama ụfọdụ dị mma kwesiri ka a nabata ya ma chekwa ya nke ọma. Ya bụ na ụjọ ekwesighị ịtụ onye Igbo ọbụla isonye n'ụfọdụ omenaala Igbo ndị dị mma na-abụghị ịgọ mmuo. Ihe mere m ji jiri ọja et0 chineke - Fada Chidika Okolie Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43388962,https://www.bbc.com/igbo/43388962,Trump na Tillerson: Trump achụọla Rex Tillerson n'ọrụ,Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump nọ n'igwe twitter chụọ odeakwụkwọ mba ahụ bụ Rex Tillerson were onyeisi ndị ọrụ nchekwa CIA Mike Pompeo nọchie ya.,"Tillerson bịara Naịjirịa ụnyaahụ wee hụ onyeisiala Muhammadu Buhari Onye nkwuchite ọnụ Tillerson kwuru na ọ matara maka ọchụchụ achụrụ ya oge ọ hụrụ ihe Trump dere na twitter ebe ọ na-ekele ya maka ọrụ ya dịka onye karịsịrị n'ọkwa na ịnọchiteanya mba US. Tillerson bubu onyeisi ụlọọrụ ExxonMobil nwere ụfọdụ nghọtahie dị n'etiti ya na Trump n'afọ gara aga. Trump họpụtakwara Gina Haspel ka ọ bụrụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisi ndị CIA. Cheta na Tillerson na onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ n'Aso Rock Abuja ụnyaahụ oge Tillerson bịara Naịjirịa na njem ọ bịara na mpaghara Afrịka. Tillerson bụ onye ahịa mmanụ nwetara ọkwa a naanị n'afọ gara aga. Oge Trump na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụọnụ na mbara White House taa, o kwuru na nsogbu ya na Tillerson nwere rutere na nghọta ha abụọ. ""Ihe na-adabara anyị nkeọma mana anyị anaghị ekwekọta n'ụfọdụ ihe,"" ka Trump kwuru. ""Ile anya na atụmatụ gbasara Iran, echere m na ọ jọka. O nwere ike o chere na ọ dị mma. ""Achọburu m itisa ya maọbụ mee ya ihe mana o cheghi etu ahụ, nke a pụara na anyị anaghị echekọ echiche. ""Mana etua Mike, Mike Pompeo batara, anyị na-echekọ echiche, echere m na ọ ga-aga nkeọma"". Tillerson bụ onye ikpeazụ n'ọnụọgụgụ ọtụtụ ndị ọrụ Trump wegoter isi jiri aka ha gbaa onwe ha arụkwaghị m maọbụ Trump chụrụ n'ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43939675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43939675,Nọt Koria kwuru na ha ga-emechi ụlọọrụ ngwaagha nuklịa na Mee,Ụlọọrụ onyesisiala Not Koria ekwuola na ha ga-emechi ebe ha na-emepụta ngwaagha nuklia dị na Punggye-ri na mba ahụ n'ọnwa Mee.,"Ebe a na-emepụta ngwaagha nuklia dị na Punggye-ri Nọt Koria dịka foto e siri n'igwe see n'afọ 2013 siri gosi ya Punggye-ri nke dị na ugwu mba Not Koria bụ ebe kachasị n'ebe ndị mba ahụ hiwere maka mmepụta ngwaagha nuklia. Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba ahụ bụ Yoon Young-Chan kwuru na a ga-emechi ụlọọrụ ahụ n'ihu ọha mmadụ nakwa ndị ọkacharamara n'ihe gbasara ngwaagha nuklia ndị mba Saụt Koria na mba Amerịka ndị ha ga-akpọ oku ka ha bịa hụ ka o si mee. Young-Chan sịrị na onyeisiala Nọt Koria bụ Kim Jong-un kwuru na ya ""ga-emechi ọdọ ngwagha nuklia n'ọnwa Mee"". Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala Nọt Korịa kwụkwara na ya ""ga-akpọ ndị ọkachamara si Saụt Koria na US oku ka ha bịa gba aka ebe ka ihe a siri gaa, iji gosi mba ụwa na ọ bụ ihe ha kwuru ka ha na-eme"". Ndị sayentistị kwuru na ụlọọrụ ahụ adakpọwala kemgbe ọnwa Septemba. N'ụbọchị Fraide, onyeisiala Nọt Koria na ogbo ya nke Saụt Koria kwekọrịtara ikpochapụ ngwaagha nuklia na mpaghara ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50182277,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50182277,Business in Nigeria index: Ịchụntaego na Naịjriịa ewerela nkatụ 15 rigo - World Bank,Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ebuliela Naịjirịa n'ogogo n'ihe gbasara ịchụntaego.,"Naịjirịa bụ ndị na-agbabu ndị nke 146 n'afọ 2018, nọzị 131 ugbua dịka onyeisiala Muhammadu Buhari dere n'akara Twitter ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba 2019. Nke bụ na Naịjrịa agafeela mba iri na ise n'ọsọ usoro ịchụntaego. Content is not available End of Twitter post, 1 N'agbanyeghị, ndị na-achụ ntaego na mba ahụ sị na ọ bụghị ihe ya bụ akị ilu na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ n'ụtọ. Ihe a bụ ogoogo ụlọakụ mbaụwa na-ahazi n'ime mba 190 ha ji amata ọkaibe kwa afọ. Ọnụ na-ekwuru ndị na-agba ahịa na Naịjirịa bụ Austin Nwosu, kwuru na n'ezie ahụhụ belatara n'ịgba ahịa ofesi. Ọ sị na kemgbe e hibechara ya bụ atụmatụ ha kpọrọ ""ease of doing business"", na ahụhụ belatara nke bụ na mmadụ nwereike ibu ahịa ya si mba ofesi n'abalị abụọ. Nwosu sị na ""e wepụrụ ụfọdụ ndịọrụ na-enwocha ibu na wọọfụ, bụ ndị na-adọghachị ọrụ azụ"". Ọ sị na ihe fọrọ ugbua bụ ime ka ndịọrụ niile so n'otu nwee oghere ị na-eji kọmputa, nke ga-eme ka ndịọrụ niile nweeike ịrụ ọrụ ha n'otu oghere ahụ. Ọ sị na ha etiela mkpu ya tigara ndị ọnụ na-eru n'okwu mana ha anụbeghị. Nwosu sịkwa na ajọ ụzọ sokwa na-adọghachi ọrụ azụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''" afirika-55794729,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55794729,Ernest Asuzu: Ihe ise ị maghị maka nwa amadi a lara mmụọ,Onye ejije Nollywood a ma dịka Ernest Asuzu anwụọla.,"Emeka Rollas bụ onyeisi ngalaba jikọrọ ndị na-eme ejije na Nollywood, gwara BBC Igbo na ọ kubiri daa ma ghara ibilite ọzọ. O kwuru na e buru ya gawa ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ tupu a garuo ụlọọgwụ. Rollas kwuru na ọ nọ na-arịabu ọrịa, mana ọ gbakere tupu ọdachi a emee. O kọwaghị ya bụ ọrịa. Onye ka Ernest Asuzu bụ? Ernest Asuzu bụ onye na-eme ejije Nollywood, otiegwu, onye na-emepụta ihe nkiri nakwa onye a na-ekiri n'onyonyo kwa mgbe kwa mgbe. A ma ya dịka onye na-akpakarị agwa dịka ogbu mmadụ n'ejije. O bidoro wuwe mgbe o mechara ejije Nollywood akpọrọ ""Another Campus Queen"" n'afọ 90s. Ọrụ ya ka dịcha ọhụrụ bụ egwu o tiputere ọhụrụ n'afọ 2020 akpọrọ ""The Truth."" Asuzu bụ nwafọ Imo steeti mana o toro na Legos dị na Naịjirịa. Ọkpụrụkpụ ihe maka Ernest Asuzu Asịrị feghariburu na Ernest Asuzu anwụọla mana ọ pụtara n'oge ahụ kwuo na ọ ka dị ndụ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46641610,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46641610,Logo Benz na egwu ndịọzọ akatọrọ maka na ha kwadoro ihe ọjọọ,"Soshala midia nwuru ọkụ ụnyaahụ maka egwu ọhụrụ onye otiegwu Olamide nakwa Lil Kesh wepụtara akpọrọ ""Logo Benz"".","Nke a bụ maka ụfọdụ ebe ọ dịka ọ kwadoro ọgwụ ego nke na-ewu n'ọnụ ụmụntorobia na Naịjirịa ugbua. O kwuru n'ime egwu ahụ ""ọ bụrụ na ego abataghị, m ga-eme ọgwụ ego o"". Ndị mmadụ dịka Terrybrainz sị na o bụghị ihe dị nma ebe ndị ntorobia na ndị otiegwu nọ End of Twitter post, 1 Onye ọzọ dịka @officialdaddymo kwuru na ọ bụghị ihe niile ka a ga-na agụ n'ime egwu Mana @JajaPhD kwuru na egwu ahụ bụ ihe na-eme n'obodo ka ọ na-ekwu maka ya Olamide na Lil Kesi o nwebeghi onye pụtara ịkọwa maọbụ kwuo ihe ọbụla maka egwu a. Lee egwu ndịọzọ agụrụ dịka ha akwadoro ịhe ọjọọ. Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị" 43986560,https://www.bbc.com/igbo/43986560,Ụlọikpe ajụla na-agaghị ahapụ Dino Melaye rue Juunu 11,Sinetọ na-anọchi ndị Kogi west n'ụlọomeiwu sineti bụ sinetọ Dino Melaye eruola na steeti ya bụ Kogi maka na ndị uweojii chọrọ ikpọga ya n'ụlọikpe taa.,"E ji ụgbọala ọrịa buga Melaye Kogi steeti Ndị uweojii jiri ụgbọala e ji ebu ozu na ndị ọrịa we buga ya ebe ha kpọgara ya n'ụlọikpe nta na steeti ahụ. E buru ụzọ buga ya n'ụlọọrụ ndị uweojii na-ahụ maka ndị ohi a na-akpọ SARS n'aha ịchafụ. Ndị uweojii kwuru na ha na-ebo Melaye ebubo mmehie akparakpa ya na ndị mmadụ mere, imebi ngwongwo gọọmenti, ịnwa igbu onwe ya nakwa ịgbapụ n'ebe e jidere ya. Ụlọikpe a a na-akpụpụ ya taa na-eso ka ndị ụlọọgwụ hapụrụ ya dịka e gosiri na o nwereike ịgali ụlọikpe. Dino Melaye Cheta na Melaye nwetara onwe ya n'ụlọọgwụ ịka ọ siri n'ụgbọala ndị uweojii bu ya wụpụ ụbọchị 24 Epurel n'ụzọ Kogi. E kwukwara na okweghi ka ndị uweojii nwụchigharịa ya ọzọ dịka ụfọdụ ndị nọ ya nsọ dị njikere imeru ndị uweojii ahụ ma ha chọọ ịnwuchu ya. N'aka nke ọzọ, onye omeiwu ahụ gbanahụrịrị nkata ịkpọghachi ya dịka ndị Inec mere nyocha maka ndị binyere aka ka a kpọghachite ya mana ndị bịara erughi pasentị iwu kwuru. Nyocha ahụ nke e mere ụbọchị satọde abalị 28 ọnwa Epurel nyere Melaye mmeri ebe ndị binyere aka ahụ egosighi onwe ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" afirika-51941033,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51941033,Coronavirus in Nigeria: Mmadụ ise ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa,Mmadụ ise ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.,"Ọbụghị ndị nọ na foto a ka a na-ekwu maka ha. Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde. End of Twitter post, 1 Nke a pụtara na ndị butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa eruola asatọ. Abụọ n'ime asatọ a agbakeela. Ụlọọrụ NCDC kwuru na mmadụ ise ọhụrụ mere njem gaa mba Briten maọbụ Amerịka. Ọbụghị n'aka onye mbụ bubatara ọrịa ahụ ka ha si bute ya. Naịjirịa amachiela Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ndị niile ha na ndị ahụ mekọtara ahụ kamgbe ha lọtara. Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa machiri ndị si mba ebe coronavirus ka njọ ịbata na Naịjirịa. N'ọgbakọ 'Federal Executive Council' n'ụbọchị Wenezde ka a nọrọ nwee nkwekọrịta a." 52388402,https://www.bbc.com/igbo/52388402,"Coronavirus Nigeria: Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa eruola 50,000","Dịka ngalaba mgbochi na mfesa ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' si kwuo ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa akarịala puku iri ise (50,000) ugbua.","Ụlọọrụ na-echeta Dọkịta Stella Adadevoh nyere gọọmentị etiti ọtụtụ ihe nchekwa onwe maka ọrịa Covid-19 Nke a mere ka Naịjirịa bụrụ mba nke atọ n'Afrịka ebe akachasị nwee ndị bu ọrịa. South Africa na Egypt bụ ndị nke mbụ na ndị nke abụọ. A bịa na Naijiria, Legọs steeti ka ndị bu coronavirus gbara kasaa; mmadụ 17,092 bu ya bụ ọrịa na steeti ahụ. Akụkọ ọma dị na ya bụ na ọtụtụ ndị butere ya bụ ọrịa agbakeela ugbua, mana nke ọjọọ bụ na ndị ya bụ ọrịa gburula fọrọ obere ihe ka ha ruo otu puku. Ọnụọgụgụ gosiri na ndị butere ya bụ ọrịa gbaliri elu kamgbe gọọmentị kpọghechara obodo n'ọnwa Mee. Mana ọtụtụ ndị ọkacha mara na-ekwu na a mabeghi eziokwu mmadụ ole nwere ya bụ ọrịa na Naịjirịa n'ihi na anaghị eme nnyoch otu o kwesịrị. Ndị ọrụ ahụike so ebuso ọrịa Covid-19 agha na Naịjirịa ekwukwaala ugboro ugboro na gọọmentị anaghị enye ha akụrụngwa zuru oke ha ga-eji chekwaa onwe ha bụ nke kpọrọ 'Personal Protective Equipments. (PPE). Ugbua, ụlọ okpukperechi niile amalitekwala ọzọ ebe ụmụakwụkwọ nọ na sekọndịrị nke isii alaghachila ụlọakwụkwọ ma malite ule ha. Mana gbadatụ ka ị hụ etu coronavirus si emetụta ndị mmadụ na mba ụwa niile. Kemgbe coronavirus jiri bata na Naịjirịa site n'aka otu onye mba Spen na Febụwarị 27, 2020, ọtụtụ ihe gbanwere maka etu nje coronavirus a si egbu mmadụ. Ihe ndị dịka ngagharị, ahịa na nke kacha nke, mmechi obodo. a anyị lele akara ndị buterela coronavirus n'oge Naịjirịa busoro ya bụ agha a ọgụ. Mana ụlọọrụ na-elebaanya n'ihe gbasara ọrịa na-efegharị bụ National Center for Disease Control - NCDC n'ịchafu bụ ndị na-enye akara ndị niile buterela nje a na Naịjirịa kwa ụbọchị N'ụbọchi 22 Epreel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụbọchi 21 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: N'ụbọchi 20 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: Ụbọch 19 Eprel, 2020 nweterela ndị buterela coronavirus bụ: Ụbọchị a bụ mgbe ndị NCDC pụtara rịọ arịrịọ maka: Na 18 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: N'ụbọchi 17 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: N'ụbọchi 16 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: N'ụbọchi 15 Eprel, 2020 ndị buterela coronavirus bụ: Lee ndị buterela coronavirus na Naịjirịa n'Eprel 14, 2020: Na Eprel 13, 2020 ndị buterla coronavirus bụ: Na Eprel 12, 2020 ndị buterela nje a bụ: Na Eprel 11, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 10, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 10, 2020 ka onyeisi ndị NCDC na BBC nwere mkparịtaụka a kpọrọ 'Kwuo Uche gị': Ndị buterela nje a na Naịjirịa n'ụbọchị Eprel 9, 2020 dị ebe a: Ndị buterela nje a na Naịjirịa n'ụbọchị Eprel 8, 2020 dị ebe a: N'ụbọchị Eprel 7, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 6, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 5, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 4, 2020 ndị ọrụ NCDC kwupụtara ndeghie ha dere maka ndị buterela nje a ha depụtara ebe a: N'ụbọchị Eprel 3, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 2, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Eprel 1, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Maachị 31, 2020 ndị buterela nje a bụ: N'ụbọchị Maachị 30, 2020 ndị buterela nje a bụ:" 46257830,https://www.bbc.com/igbo/46257830,#NextLevel: Nkwa ọhụrụ iri Buhari kwere,Ụbọchiụka ka ndị na-azọ ọkwa ọnyeisiala Naịjiria nakwa gọvanọ malitere ịchụ nta vootu maka ntuliaka 2019.,"N'emume iji mee nke a nke onyeisiala Buhari hiwere na Abuja, o kwuru na ọchịchị ya emejupụtala nkwa o kwere na ntuliaka gara aga site na-ịtọ ntọala maka ọganihu ala Naijiria. Lee ụfọdụ n'ime nkwa Buhari na APC na-ekwe ha ga-emere ụmụ Naijiria ma ọ bụrụ na ha tụnyere ya ọzọ n'afọ 2019. 1. Anyị ga-ahazigharị agụmakwụkwọ Anyị ga-arụgharị ụlọakwụkwọ dị 10,000 kwa afọ ma zụgharịa ndị nkuzi n ikuzi sayensi, teknụzụ, nka, mgbakọ na mwepụ 2. Rutọpụ akwa mmiri nakwa ọkporoụzọ Ha kwere nkwa ịrụpọ akwammiri Naija nke abụọ 3. Anyị ga-aga n'ihu ibu agha megide nrụrụaka N'agbanyeghị oko anyị nwara n'imechi ụzọ , ọrụ ka dị n'ịhụ na nrụrụaka n'ala anyị 4. 5. Anyị ga-ewepụta ohere ọrụọhụrụ rụrụ nde 15 N'ịganihu, ebe anyị ka etinye aka na ya bụ ọrụ site na ịmụba atụmatụ N-Power nakwa ọrụugbo na ndị ọrụaka. I nye ndị ọrụugbo na ndị na-ere ihe ọrụ site na mbuli ụmụakwụkwọ gọọmentị na-enye nri site na nde 9.2 rue nde 15 6. Inye ịntanet n'efu na ebe ụfọdụ Ha na Google ga ejikọrịta aka ime ka enwe ịnaneti na efu n'ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ nakwa ahịa. Mana nkwa ndị kpalitere iwe ụfọdụ ụmụ Naijiria. 7. A ga-enye ụmụnwaanyị ọkwa ruru pasent 35 A ga-enye kwa ndị ntorobịa ọkwa na gọọmentị 8. Atụmatụ ahụike maka mmadụ niile 9. 11,000 megawat ọkụ latrik I welite ọkụ latrik megawat 1000 kwa afọ ganye na o rue megawati 11,000. 10. I mepe ụlọakụ ọha Ihiwe ụlọakọ ga na-agbazinye ndị ahịa na ndị ọrụaka obere ego mgbazinye ruru otu nde naira. Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia Ha na-ajụ Buhari na APC ihe mere nkwa mbụ ha kweburu. @Josiah_Madi jụrụ ebe ka Buhari dugara ndị Najiria na mbụ? @Romeosreal1 kwuru na Nextlevel of ihe isika , ihe ịda oke ọnụ ahịa, oke ogbugbu mmadụ Okwudili Michael jụụ ma ọ bụ mgbanwe ahụhụ o wetara ka ọ chọọ ibuli n'ogoogo ọhụrụ? Mana ụfọdụ dịka Semiu Okanlawon kwụnyere Buhari Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46300209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46300209,Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ gara hụ Onyeisiala Buhari,"Ụbọchị Nọvemba 21, 2018, ka gọvanọ ndị ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa zukọrọ n'Abuja ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'obi ya.","Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Ndị gara ya bụ ọgbakọ ime ụlọ gụnyere Gọvanọ Abia, Enugwu nke Ebonyi, nakwa osote onyeisi ụlọomeiwu bụ Ike Ekweremadu. Mgbe ha mechere ya bụ ọgbakọ, onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ Dave Umahi, gwara ndị ntaakụkọ na ha gara ikele Onyeisiala Buhari maka ọrụ ọma ya n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa. Ọ sịkwa na isi ije ha bụkwa ịrịọ onyeisiala ka o tinyekwuo ego n'ọrụ n'ọwụwa-anyanwụ. N'olu ya, Umahi kwuru, ""anyị bịara ikele Onyeisiala maka mbọ ya gbarasa akwammiri Naịja nke abụọ (Second Niger Bridge) bụ nke Julius Berger na-arụ n'ọnụ ego dị ijeri narị abụọ na isii (206bn) bụ nke enyegoro ha ijeri asaa (7bn). Anyị bịara ịrịọ Onyeisiala ka o jisiike nyezuo Julius Berger ọkara ya bụ ego ọrụ ka anyị wee mara na gọọmenti akwadola ya bụ mgba n'ezie."" Mgbe ajụrụ ya maka ntuliaka 2019, Umahị zara na onweghị ihe ha kpara gbasara nke a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45532484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45532484,EFCC agọọla na ọbụghị ha zigara ndị ọrụ ha wakporo ụlọakụ Standard Chartered,"Dika ụlọakụkọ Reuters siri kwuo,ụlọakụ Standard Chartered dị na Legọs ụbọchị Friade.","Akụkọ kwuru na ndị ọrụ EFCC gara ije ahụ gbalịrị ịnwụchi onyeisi ọrụ ụlọakụ ahụ a kpọghị aha ya. Mana mbọ ha mara afọ n'ala n'ihi na onye ha chọtara kpochiri onwe ya n'ime ụlọọrụ. O doghị anya ihe mere ha jiri wakpo ụlọakụ ahụ, mana cheta na Standard Chartered so n'ụlọakụ anọ, ụlọakụ etiti bụ CBN riri iwu maka inyere ụlọọrụ ekwentị MTN ibupụ ego ruru ijeri dọla 8.134 n'ụzọ megidere iwu. Ụlọakụ Standard Chartered kwuru na o nweghị ihe ha mere bụ nke kwesiri ịkpọta ndị ọrụ EFCC n'ụlọọrụ ha. Ha kwukwara na ndị ọrụ EFCC bịara ma lakwa na-egbughi oge ọbụla. EFCC bụ ngalaba gọọmenti etiti na-enyocha nrụrụaka na Naịjirịa Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren kwuru na ozi o wepụtara na EFCC awakpoghi ụlọakụ ahụ kama ọ bụ aka ọrụ ndị ọrụ nnupuisi ha ndị na-aga ozi ezighi ha. O kwuru na EFCC ga-enyocha ndị gara mwakpo ahụ. ""A na-akpọ ndị isi ọrụ ndị ụlọọrụ a oku ma ọ bụrụ na EFCC chọọ inyocha ha. ""N'oge gara aga, ndị ụlọakụ na-akwado ọfụma inyocha ndị ọrụ ha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45041619,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041619,Ndị ndọrọndọrọ agba ọhụrụ jị soshal midia eru ndị ntorobịa,"N'afọ 2015, ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na Naịjirịa hụrụ soshal midia ka ihe dị mkpa maka irute ndị ntorobịa ma hụ na ozi ha ruru ha aka etu ha si zipụ ya.","Kingsley Moghalu bụ onye okaiwu bụrụkwa osoteonyeisi nke ụlọakụ kacha elụ na Naịjirịa n'afọ 2009 - 2014. Mgbe ahụ, onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari nwetere ezigbote nhazigharị n'aka ndị ntorobịa site n'ọrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya nyere 'Red Media', bụ ụlọọrụ ndị ntorobịa abụọ; Chidi Jideonwu na Adebola Williams nwe. Onyeisiala nọ n'ọchịchị mgbe ahụ bụ Goodluck Jonathan jikwara soshal midia mee ihe o ji agwa ndị ntorobịa okwu, nke mere ulọ ntaakukọ CNN jiri kpọ ya ""Facebook President"" n'afọ 2010. Ugbua, ka ndị ndọrọndọrọ na-ahazị maka 2019, ụfọdụ n'ime ndị chọrọ ka atunyere ha dịka onyeisiala ebidola iji soshal midia eme ka ndị ntorobịa mata na ha zuru ka e mee. Fela Durutoye, bụ onye na-azọ ọchịchị ịbụ onyeisiala were otu akara na-ewu akpọrọ #ADENINY nke nwaaafọ Charles Okocha wepụtara mee ihe ọchi na Twitter. End of Twitter post, 1 Kingsley Moghalu bụkwa onye ọzọ chọrọ oche onyeisiala wepụtakwara nke ya bụ ebe ya na onye otiegwu @falzthebadguy mere ebe ha na-agba egwu na-ewu a kpọrọ 'Shaku-shaku.' Ihe ndị a na-eme ka ụfọdụ ndị a na anọghị na pati na-achị maọbu nke na anọghị gbakọtara mee nzụkọ ebe ha nwere mkparịtaụka maka etu a ga-eji mee ntuliaka nke 2019. O nwebeghị ihe ekwupụtara maka nkata ha kpara na nzụko ahụ, mana Moghalu dere na Twitter na mkparịtaụka ha gara ọfụma. A mabeghị ma ndị mmadụ ọ ga-akwado ndị a, mana ha na agbali ike ha iweta ndị ntorobia na soshal midia." afirika-52851248,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52851248,Biafra Remembrance 2020: Etu onyeisi Ipob si cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra na Mee 30 nke 2020,Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra ekwuola uche ya gbasara ncheta ndị niile nwụrụ n'agha Biafra taa bụ ụbọchi Mee iri atọ.,"Kanu kwuru na ya agaghị echezọ ndị niile nwụrụ ma lụọ agha Biafra bidoro n'afọ 1967- 1970, anyị ga na-echeta ụbọchị iri atọ Mee ọbụla ma kwanyere ha ugwu diri ha. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru ka ọ kwanyechara ndị niile nwụrụ na ya bụ agha ugwu. Cheta na Kanu rịọrọ ndị otu ya ha buo ọnụ maka ncheta nke afọ 2020. Chetakwa na onye okaikpe Mazi Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako gwara BBc Igbo na mkparịta ụka ha nwere n'oge gara aga na emume ị nọ n'ụlọ nke afọ a agaghị eme maka ọrịa coronavirus. Taa bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee bụ ụbọchị Igbi niile ji echeta ndị nwụrụ n'agha Biafra malitere n'afọ 1967. N'ihi nke a BBC Igbo hibere mkparịtaụka ebe ndị bụ isi ahụrụ kwaba okpu n'ala Igbo bịara sonye. Ha gụnyere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo, Onyeka Onwenu bụ otiegwu a ma ama nakwa Tony Nnadi bụ onye na-achọ mmwereonwe mpaghara ndịda Naịjirịa. Na mkparịtaụka a, Nnia Nwodo kwuru na o nwere atụmatụ a na-akwado ịwepụta nke ga-enyere aka ịwulite ala Igbo. Atụmatụ ahụ, nke ka bụ alo atụrụ gụnyere ndị Igbo ịtụkọ ego dịka otu narị naira kwa mmadụ iji rụpụta ngalaba nke ha ga-enwekwa oke n'ime ya. Ihe ha hụrụ n'agha Biafra: Nnia Nwodo bụ onye mbụ kọwara ihe anya ya hụrụ. O kwuru na mgbe ahụ, onye ọbụla ruru ""5ft 6"""" na-esonye n'agha ahụ nke ụmụaka akpọrọ ""Organization of Biafran Freedom Fighters"" ""Anyị na-aga alụ ọgụ n'ebe ndịagha Naịjirịa nọ"" ka o kwuru. O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme Onyekwa Onwenu kwuru na o nyere aka n'agha Biafra site n'ịnye aka n'ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ndị merụrụ ahụ n'agha. N'ọnụ ya ""a mụrụ m ọrụ izuụka abụọ tupu m mmalite ọrụ, anyị na-akụziri ndị mmadụ gbasara nri ha ga-eri"" O kwuru na ọ dị mkpa ka ụmụ Igbo niile mara ihe mere n'agha ahụ n'ihi na agụrụ gburu ọtụtụ mmadụ na ahụhụ ndị ọzọ ndị Igbo tara. Tony Nnadi n'onwe ya kwuru na amụrụ ya n'afọ 1966 nke mere na ọ ka dị afọ atọ mgbe agha biri. Mana n'uche ya agha ahụ ebibeghi ya mere na o sonyere ndị na-agagharị na-achọ ihe a ga-eme ka agha ahụ bie n'ezie. Ndụmọdụ ha nyere ndị Igbo Tony Nnadi kwuru na njem ndị Igbo na ndị Naịjirịa kwesiri ka achịkọta ya ọnụ ka o were bie ebi. O kwuru na akụkwọ Iwu Naịjirịa kere ndị Igbo agbụ n'aka n'ihi na o nweghi onye ga-eji ya zọọ ọkwa ọbụla ọ chọrọ ị zọ ma zọta ihe. Ọ gwara ndị na-achọ mwereonwe Biafra na nkata akpara iji ""bupu ozu Naịjirịa"" amịtala mkpụrụ. Onyeka Onwenu gwara Igbo niile na site ugbua gaa ihu, ha welie isi ha elu ka onwe ha ju ha afọ. ""Unu asizina ndo maka na unu bụ ndị Igbo, bụrụ nụ ndị kachasị n'ihe niile unu na-eme"" ka o kwuru. Ihe ọzọ o kwuru na Igbo kwesiri na ịgba mbọ n'ọgbakọ nakwa na nke onwe ha n'ihi na anyị bụ ndị Igbo. Nnia Nwodo kwuru na ọnọdụ ndị Igbo nọ na ya bụ ihe na-ewute onye ọbụla, Ọ sị ""ọbụru na anyị apụtaghị n'ọnọdụ a, o nwereike ịbuba anyị n'agha ọzọ, Chineke mee ka ọ ghara ịduba anyị n'agha"" O kelere ndị ntorọbịa na-eche nche n'ebe dị ịcheiche n'ala Igbo ma gwa ha jisike na ha bụ ndị nna kwụ ha n'azụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-47202455,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47202455,Nigeria Election 2019: Etu ị ga-esi tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka,"Dịka ọ fọrọ ụbọchị ole na ole tupu ụbọchị ntuliaka eruo, ọ nwere ụfọdụ ihe ị kwesiri ịma.","Ngalaba na ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ewepụtala ụzọ asaa ị ga-esi tụọ vootu gị n'ụzọ kwesiri. Nke a kachasị mkpa n'ihi na ọ bụ ụzọ ị ga-esi tinye anya gị ma hụkwa na ihe niile gara etu o si kwesi. Lee ihe ndị asaa ahụ ebe a: Mbụ Ị ruo n'ụlọ ntuliaka nke bekee kpọrọ ""Polling Unit"", ị ga-eme ihe abụọ ebe a; nke mbụ bụ na ị ga-akwụnye n'ahịrị dịka ndịọzọ nọ ebe ahụ. Nke ọzọ bụ na ị ga-egosi PVC gị nakwa onwe gị nye onyeisi ndịọrụ ntuliaka ga-anọ ebe ahụ. Ihe abụọ Onye ọrụ ọzọ ga-ajụ gị ebe PVC gị dị ka o nwee ike nyocha ma ọ bụ nke ezigbo ya. Ọ ga-agwakwa gị binye aka n'igwe 'card reader' iji mata ma edenyere aha gị n'ụlọ ntuliaka ebe ị nọ. Ihe atọ Onye ọrụ ọzọ ị ga-ahụ ga-anara gị PVC gị iji mata ma aha gị na njirimara gị niile ọ dị n'akwụkwọ i ga-eji eme ntuliaka. Ọ ga-atụpọ aha gị, nyeghachi gị PVC gị ma detụ uhie anaghị eme mgbụcha na mkpịsịaka gị iji gosi na ị tozuru ime ntuliaka. Ọ bụrụ na aha gị adịghị n'akwụkwọ ndị ga-eme ntuliaka, agaghị ekwe ka ị mee ntuliaka. Ihe anọ Onye ọrụ ya bụ ịchịkọta ntuliaka ahụ ga-ama njirimara, dee ụbọchị ọ bụ ma binye aka n'azụ akwụkwọ ị ga-eji mee ntuliaka nke pụtara ""ballot paper"" na bekee. Ọ ga-alọkọ akwụkwọ ahụ ma nye gị ya gosikwa gị ebe zoro ezo ị ga-anọ mee ntuliaka. Ihe ise Ị ga-ebinye aka n'uhie anaghị eme mgbụcha, ma binyekwa ya n'akụkụ pati maọbụ onye masịrị gị. Ị ga-alọkọ akwụkwọ ballọt ahụ etu onye nchịkọta ntuliaka siri nye gị ya. Ihe isii Ị ga-esi n'ebe zoro ezo pụta ma tụnyekwa akwụkwọ balọtụ gị n'ime akpati balọtụ n'ihu ọha niile nọ ebe ahụ. Ihe asaa Ị ga-ejiri nwayọ pụọ n'ụlọ ntuliaka ahụ maọbụ ị cheretụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe pụtara na ntuliaka ahụ. Matakwa na Inec ga-amado ihe pụtara na ntuliaka ọbụla ebe mmadụ niile nọ n'ụlọ ntuliaka ga-ahụ ya." afirika-53619748,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53619748,Big Brother Naija 2020: Onye ga-emeri n'afọ a?,"Ajụjụ ọtụtụ ndị na-eso emume a na-eme n'ihe onyonyo bụ nke a kpọrọ Big Brother Naija Lockdown na-ajụ bụ ""onye ga-emeri nke afọ 2020""?","Dịka a banyerela izu abụọ n'ime izu iri ha ga-anọ n'ime ụlọ Big Brother, ndị na-elele ya bụ emume enweela ndị ha na-akwado nakwa ndị ha achọghị iji anya ahụ. Ị chọọ Big Brother Naija Season 5 n'elu ịntanetị ugbua, a ga-agụta ihe ruru mmadụ asatọ maọbụ karịa bụ ndị a na-akpụkarị aha ha n'ọnụ n'ime mmadụ 20 nọ ya n'afọ a. Ndị a gụnyere Nengi, Laycon, Ozo, Dorathy, Erica, Kiddwaya, Prince, Wathoni, Ka3na, wdgz. Ọtụtụ ndị Big Brother na-amasị ekwuola na onye ga-emecha merie nke afọ a ga-esi n'ime mmadụ asatọ a pụta, ma ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya. Mana kedụ etu ndị meriri n'afọ ndị gara aga si merie? A bịa n'ihe gbasara emume a, ọ bụ iwu na ọ bụ ndị na-ewu ewu na-emeri? N'afọ ndị gara aga, ọ bụ ndị kacha masị ndị na-elele ya n'onyonyo ha na-ekpebikarị (site n'ịtụnyere ha vootu) onye ga-emeri. N'ime Katung, Efe, Miracle, na Mercy meriri nke afọ ndị gara aga, ọ bụghị ha niile malitere n'izu nke mbụ ha nọ n'ime ụlọ wuwe ewu. Ndị dị ka Katung na Miracle mechara chakee dịka ụbọchị nọ na-aga, nke bụ na e nwekwara ike ọ gaghị abụ ndị nke na-ewu ugbua n'ụlọ Big Brother nke afọ 2020 ga-emecha merie. Mana nke afọ a, ọ bụ ndị na-elele tụnyechaa vootu, ndị nọ n'ime ụlọ Big Brother esi n'ime mmadụ anọ ndị otu ha vootu ha kacha pee mpe họrọ ndị ga-ala. Ndị ọbụla ndị otu ha kacha họrọ dịka onye ha chọrọ ka ọ laa, ka a ga-achụpụ n'ụlọ. Ndị meriri na mgbe ha meriri Katung Aduwak: Katung meriri n'afọ Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-achịkọta Big Brother Naija ugbua, sonyere na ya O meriri Big Brother Nigeria nke e mere n'afọ 2006 (nke mbụ a na-eme na Naịjirịa). Katung esoghidi ibe ya bata n'ụlọ n'isi mbido; o so na ndị batara ka a chụpụcharalarị mmadụ abụọ, mgbe izu atọ ya bụ emume malitere. Efe 'Efemoney' Ejeba Efe meriri Big Brother Naija nke a kpọrọ See Gobbe, nke e mere n'afọ 2017. Efe pụtara n'ọgbọ ebe a họpụtara ndị a ga-atụ vootu iji zọpụta, ugboro ise. Miracle 'Flyboy' Ikechukwu Igbokwe Ikechukwu meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2018, nke a kpọrọ Double Wahala. Miracle kpara ike site n'imeri ọtụtụ egwuregwu na asọmpi ndị ha mere n'ụlọ ahụ, ndị gụnyere Payporte Arena Games, Final Wager nakwa Pepsi Refresh Your Mix. Ya na otu nwaanyị nọkwa n'ime ụlọ kwara iko ka ha ka nọ n'ime ụlọ, mana nke ahụ egbochighi ya imeri. Mercy 'Lamborghini' Eke Eke meriri Big Brother nke e mere n'afọ 2019, nke a kpọrọ Pepper Dem. Mmeri a mere Mercy na-akpọ onwe ya ""queen of highlights"" nwaanyị mbụ na-emeri emume a. Ọ bụghị naanị ịgbabi 'wire' n'egwu ka e ji mara mgbe ahụ, ihe ọzọ e jikwa mara ya bụ na ọ chọtara ịhụnanya ka ọ nọ n'ime ụlọ ahụ. Kedụ onye ga-emeri nke afọ a? Na nke afọ a, kepukepu na-ekwu na ụfọdụ ndị akwaala iko, ọtụtụ amịala ọnụ, mana ọ ga-enyere ha aka ka ọ ga-egbochi ha imeri? Kedụ onye i che ga-emeri nke afọ a? Gịnị ka ị chere mere ọ ga-eji merie?" afirika-44338098,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44338098,Akụkọ kachasị n'abali a: Ibrahim Idris akpụpụla Sineti ụlọikpe,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Mgba anyị ga-ama onye ike ga-agwụ,"Ndị uweojii na ndị agha enwebeghị ike ịkwusị ogbugbu mmadụ na Benue steeti Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris a gaala ụlọikpe ị gbochi oku ndị ụlọomeiwu nta bụ sinetị na-akpọ ya. O kwuru na onyeisiala Naịjirịa jiri aka ya họpụta ya na ndị ga-eso ya mee njem ọrụ na Bauchi mgbe ha na akpọ ya oku a. N'Afrịka Gọọmentị mba Uganda amaala iwu ga-akwụsị mbubata ụgbọala karịrị afọ iri n'ise n'ochie Ha na-enwe olileanya na nke a ga-ebelata ọnwụ na-esi na mberede okporo ụzọ ụgbọala ochie na-ebute. Ụfọdụ mmadụ katọrọ iwu a na-ekwu na ọ ga-ebutere ndị ogbenye ahụhụ N'akụkọ ofesi Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na mba Italy a họrọla Guiseppe Conte dịka Praim Minista ha ebe emere emụme ị du ya n'ọkwa ọchịchị taa. Cheta na kemgbe ọnwa maachị emere ntụliaka, mba Italy enwebeghị ịke ị họpụta onye ga-abụ praim minister ha N'egwuregwu, Ihe onyonyo na-egọsị uwe ọhụrụ ndị Sụpa Igụls ""Dịka nwa-afọ Naịjirịa m bụ, ọ bụ iwu dịara m na m gotere uwe a ị ji kwado otu m"" Ihe na ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị Naịjirịa na-ekwu ebe ha kwụ na ahịrị kemgbe ụzụ ụtụtụ iji gote uwe asọmpị iko mba ụwa nke Naịjirịa. Ọ na-ewuewu na ndị mba ụwa niile na-ekwu na uwe Naịjirịa bụ nke kachasị masị ha." 42933152,https://www.bbc.com/igbo/42933152,Nwoke egbụọla ịbe ya abụọ na Saut Afịrịka,Otu na enekọrịta ndị mba Naịjirịa bi na Saut Afịrịka ekwuola na akụkọ a mere eme n'ezie,Johannesbourg ebe ihe a mere bụ isi obodo Saut Afịrịka Ha kwuru na onye Naịjirịa ibe ha egbuola ndị otu ha abụọ siite n'iji mma sugbu ha n'ụzụ ụtụtụ taa. Onye odeakwụkwọ otu ahụ bụ Emeka Ezinteje gwara ndị ntaakụkọ na ihe butere onwu ndị a bụ esemokwu ego. Ọ sị kwa na ndị uwe ojii ebidola nyochapụta ihe mere eme na ka-osi mee. Ndị uwe ojii Saut Afịrịka eburu la ozu ha gaba ụlọọgwụ Enyere aha ndị a nwụrụ anwụ bụ Maazi Ekwegharịrị Chịdị onye Ehime n'Imo steeti na Maazị Nzechukwu Alabuche onye Azia n'Anambara steeti. Onye gburu ha ka-akpọrọ Sunday onye Awgbụ n'Anambara steeti kwa. Akụkọ n'apụta kwuru na Sunday agbapụla ọsọ banye na nzizo mana ndị uwe oji n'achọ ya. Asị na ebe nke a mere bụ na obodo Rossetinville na mpaghara ndida Johannesbọgụ bụ isi obodo Saut Afịrịka afirika-46950396,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46950396,Obasanjo: Ihe m jiri gbaghara Atiku,Okwu juru Olusegun Obasanjo n'ọnụ mgbe ya na onye ntaakụkọ BBC Yoruba zutere.,"Mkaprịtaụka Obasanjo na BBC Na mkparịtaụka a, Obasanjo kwuru maka onyeisiala Muhammadu Buhari na pati ya bụ APC, ma bo ha ebubo mpụ na nrụrụaka. Ọ sị; ""I nwere ike zuru Naịjirịa nafee ma I bụrụ na ị bụ onye APC. Ị bụrụ onye PDP, agbaa gị njọ gị n'ihu."" Obasanjo kwukwara maka onye bụbu osote ya bụ Atiku Abubakar, bụ onye ọ sị na ya gbaghara njọ makana ya chọrọ ka Chukwu gbaghara njọ nke ya. Obasanjo gosiri na mwakpo ndị agha Naịjirịa wakporo obodo Odi bụ ebe mmadụ 2500 nwụrụ abụghị ihe na-amapụ ya obi." afirika-52618739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52618739,E- Money: Kedụ ihe ọ na-eri inweta 'police escort'?,Emeka Okonkwo bụ onyeisi ụlọọrụ 'Five Star Group' e ji 'E-Money' mara enweghịzị ndị uweojii na-echekwa ka ọ dị na mbụ dịka Onyeisi ndị Uweojii bụ Mohammed Adamu nyere n'iwu ka a napụ ya ndị nchekwa a.,"Adamu,onye kwuru na E-money ji ndị uweojii nchekwa e nyere ya were na-eme 'bọị-bọị, dịka ha na-ejidere ya ncheanwụ ma na-ebudoro ya akpa, nyekwara iwu ka e nyochaa etu e-money si akpata ego. E-Money, onye Uli n'Anambara steeti bụ onye na-akwado egwu nke Bekee kpọrọ 'music promoter'. Ọ bụ ya nwee ụlọọrụ bụ ""5-Star Music bụ ebe ndị otiegwu dịka Harrysong na SkiiBii nwetara nkwado were wepụta egwu ha. E bidoro kpọwa 'E-money' maka etu o si eji ụlọ kara aka, ụgbọala dị oke ọnụ na ihe enweenwe ndị ọzọ egosi ọgaranya na soshal midia. E-Money bụ nwanne otiegwu a ma ama bụ KCee( ezi aha ya bụ Kingsley Okonkwo ) nke tiri egwu, 'Limpopo' na egwu ndị ọzọ. E-Money bụ onye a ma dịka onye na-akwalite ndịotiegwu mana na-atụbatakwa ahịa A makwa E-Money dịka onye na-atụbata ahịa nakwa onye na-enyere ndị mmadụ aka nke Bekee kpọrọ 'philantropist.' E-Money lụrụ nwaanyị ma jide ezinaụlọ. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Bala Elkana o kwuru sị n'ezie na ha nwetara ntụzịaka site n'isi ụlọọru ndị uweojii ka ha wepụ ndị uweojii na-echekwa E-money. Kedụ ihe ọ na-eri ndị uweojii inye gị 'escort'? Onye ọbụla bụ nwa afọ Naijiria na-enweta nchekwa ndị uweojii dịka ndị uweojii na-agagharị n'ogbe ọbụla ịhụ na obodo deere jii. Mana o nwere ndị a na-enye ndị uweojii maka nchekwa pụrụ iche n'ihi ọkwa ha nwere. Ndị a gụnyere onyeisiala,ndị gọvanọ, onyeisi Ụlọomeiwu Nta na Ụlọomeiwu Ukwu wdg. Mana onye abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ike inweta ndị nchekwa pụrụ iche n'aka ndị uweojii. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe si kọwaa, tupu ndị uweojii enye mmadụ ndị ọrụ ha ga na-echekwa ya , onye ahụ ga-ebuụzọ detara ha akwụkwọ. Ndukwe sị, "" "" I ga-etinye akwụkwọ, kwuo ihe iji chọọ ya tupu enye gị ya."" Ọ gara n'ihu sị na ""ọ bụghị onye ọbụla gbabatara n'ogige ndị uweojii enye ya nchekwa, ọ ga-enwerịrị ihe kpatara ya."" ""O nwere ike ọ bụrụ na ndụ gị nọ n'ihe egwu maọbụ dịka ụlọakụ, i nwere mkpa nchekwa pụrụ iche."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43889963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43889963,Ihe anọ ị maghị maka ọrịa ịba,Ihe karịrị ọkara mmadụ niile nọ n'ụwa gbaa gburugburu nwere nsogbu ọrịa ịba.,"Ọ dị mkpa inyocha ọbara iji mata na ọ bụ ịba Ịba bụ ọrịa a na-ebute site n'ọtịta anwụnta nke na-egosi onwe ya site na ahụọkụ na oyi ọmụma. Ọ dị mkpa inyocha ọbara iji mata ma n'ọ bụ Kedụ ihe mere n'agbanyeghị mbọ a na-agba megide ya, achụpụbeghị ya? Kedụ ụzọ anyị ga-esi chekwaba onwe anyị ịgbalahụ ọrịa ịba na mmefu ego dị na ị rịa ya? Ajụjụ a na ndị ọzọ ka Onye ọkamụta Dọkịta Chukwujekwu Ezechi onye nyocha na Nigeria Institute of Medical Research (NIMR) na ndị ọzọ zara: 1. Mmadụ ole na-arịa ịba n'ụwa? Mmadụ nde nari abụọ na iri isii (216m)rịara ịba na mba iri itoolu na n'ụwa n'afọ 2016. 2. Kedụ mpaghara kacha nwe nsogbu ịba? Ndị isi ojii Afrịka bụ ndị ọrịa ka emekpa ahụ. Pasentị iri itoolu ndị na-arịa n'ọrịa ịba nọ n'Afrịka, ebe o gbuola ihe ruru pasentị iri itoolu na otu. 3. Gini mere na anyị ekpochapụbeghị ịba? Dịka Dkta Ezechi is kọwa, ihe kachasị egbochi Naijiria imeri ịba bụ ; Anaghị etinye uchu nanchọpụta gbasara ịba, gọọmenti anaghị etinye ego na mbọ ịchufu ọrịa iba nakwa ndị mmadụ anaghị echekwa gburu gburu ha. Irahụ n' ime akwa mgbochi anwụnta 4. Kedụ ka ị ga-esi mgbochi ọrịa ịba? Site na idebe gburugburu gị ọcha, ịlahụ n'ime akwa mgbochi anwụnta na ime nyocha ọbara tupu ibido ịgwọ ịba. Dr Ezechi sị: ""Ihe na-ebute ịba bụ anwụ. Ọ na-eto n'ebe mmiri adịghị ọcha dọ. Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ kpochapụ ngwongwo dịka komkom, karama kụwara akụwa na taya na gburugburu ha."" Ahụ ọkụ niile abụghị ịba. Maka ịgbalahụ ọgwụ ịba ịnyụ ọkụ n'ihe gbasara ọgwụgwọ ịba, ndị ọkachamara ahụike gụnyere WHO na-adụ ndị mmadụ ka ha mee nyocha ọbara tupu ha ebido ịgwọ ahụokụ ọbụla ha chere na ọ bụ ịba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49404712,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49404712,Wadume arrest: Ndị uweojii anwụchigharịala Alhaji Hamisu Wadume,Alhaji Hamisu Wadume bụ onye a na-enyo na ọ bụ onyeisi ndị ntọ e ji maka ya gbagbuo ndị uweojii atọ na Taraba nozi n'aka ndị uweojii ugbua ebe ọ na-ekwe ukwe ka nnụnụ mgbama.,"Ndị uweojii nwụchigharịala Hamisu Wadume bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ndịagha gbapụtara ya n'aka ndị uweojii gara nwụchiya n'ụlọ ya na Taraba maka ebubo ntọ. N'ihe onynyo nke ndị uweojii wepụtara n'akara Twitter ha, Wadume kwupụtara n ndị uweojii jichiri ya mana ndị agha wụrụ ha mgbọ ma gbapụtara ya. ""Ha kwọrọ m ga n'ogige ha ebe ha nọrọ kwobie ịga a kụrụ m."" Cheta na ndị uweojii nwụchiburu Wadume izu ole na ole gara aga n'obodo ya dị na Taraba steeti ebe ndị agha gbagburu ndị uweojii atọ n'ime ndị uweojii nwụchiri ya ma hapụ Wadume ka ọ gbalaga. Ndị uweojii si na ha ka na-eche ndị agha ka ha zaa ajụjụ a: A gbagburu Usman Danzumi, Mark Ediale nakwa Dahiru Musa bụ ndi uweojii kara aka so nwụchibu Wadume n'ụlọ ya. N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba binyere aka, ọ gbara ama na ndị uweojii nwụchiri nwa amadi ahụ ụbọchị Tuzde abali 19 nke ọnwa Ọgọst na Kano ebe o zoro. Onyeisi ndị uweojii Naijria bụ Mohammed Adamu kelere ndị ọrụ ya ma kwuo na nnwụchigharịa e mere Wadume ga-enye aka ikughe ihe zoro ezo n'ihe mere nakwa n'okwu gbasara ike ahụ. Ikpe Atiku na Buhari Ụlọikpe kachasị na Naijiria ekpebiela na ha agaghị enye Atiku Abubakar na otu PDP ikike inyocha 'server' etiti n'ikpe onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ 2019. Ụlọikpe mkpegharị jụburu inye Atiku ikike inyocha 'server' bụ arịịrọ ọ rịọrọ nke mere o jiri gbagharịa akwụkwọ maka nke a n'ụlọikpe kachasị. Mana a mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere ụbọchị Tuzde, ha kwuru na ha agaghị ewezụga n'ụsọ mkpebi kwụ ọtọ nke ụlọikpe mkpegharị nyere erela na ya bụ okwu. N'ofesi Ọgbaghara dị n'ime gọomentị mba Itali e meela ka Praịm mịnịsta ha bụ Guiseppe Conte kwuo na ọ ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ya. Conte na onye ndu pati Nationalist League bụ Matteo Salvini na-arụ onwe ha aka n'ime ọchịchị ha gbakọtara aka ọnụ hiwe. N'egwuregwu Ọgba bọọlụ nke Manchester United bụ Harry Maguire akpọọla oku ka ndị ụlọọrụ soshal midia kwụsị ndị mmadụ izipụ okwu ịkpaoke agbụrụ. Nke a na-abịa dịka a kpọrọ Paul Pogba iyi na soshal midia maka ọ tara penariti n'asọmpi ha na ndị Wolves gbara. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile O nweghi mgbe anyị ji wakpo ụlọ Ambode - EFCC EFCC agọrọla isi ha n'akụkọ na-ekwu na ha wakporo ụlọ aka chịburu Legọs steeti bụ Akinwumi Ambode. N'ime akwụkwọ ozi ha zipụtere, ha kọwara na ọ bụ ọrụ nyocha ka ha na-eme ebe ahụ. ""Ọ bụ nyocha a na-eme ndị Gọvanọ dịka ya dịka ọchịchị ha bịara na njedebe"" ka ozi ahụ kwuru. Ha ji ohere ahụ rịọ ndị mgbasaozi ọ kachasị na soshal midia ha kpachara anya n'ụdị ozi ha na-agbasa banyere ọrụ EFCC. Otu kpọrọ onwe ha Enugwu West People's Parliament akatọọla ihe e tiri Ike Ekweremadu na mba Jamini na ngwụcha izuụka gara aga. Ha kpọkwara oku ka gọọmentị Jamini nyochaa ya bụ ihe, ma gwa ndị Igbo niile nọ n'ọchịchị sị ha ekwela ka otu Indigenous People of Biafra (IPOB) kwapụ mmụọ ha n'ọrụ ha na-arụ. N'ime akwụkwọ ozi ha zipụtere, ha kelere mmadụ niile etu ha si gbakọọ aka katọọ ihe Ipob mere Ekweremadu. ""Anyị anaghị enyocha Tunde Fowler"" Gọọmentị Naịjirịa ekwuola hoo haa na ha anaghị enyocha onyeisi Inland Revenue Service bụ Babatunde Fowler dịka akụkọ si kwuo. Ha kwuru na akwụkwọ ozi na-efegharị bụ nke Abba Kyari dere ịjụ ase maka ụgwọ ụtụ isi ezughi ezu. Ịchọrọ ịzụta anụmanụ ga-anọnyere gị? Mba Tanzania ebidola ire agụiyi nke dị na be ha. Ha na-eme nke a iji belata ọnụọgụgụ anụ ọhịa ha nke na-awakpo ndị mmadụ. Dịka ha si kwuo, agụiyi na enyi mmiri bụ anụmanụ abụọ kachasị awakpo ndị mmadụ na mba ha. N'egwuregwu, Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011 Ngalaba bọọlụ Naịjirịa bụ NFF ekwuola na mmachi ebighebi FIFA machiri Samson Siasia bụ ihe tụrụ ha n'anya. Ha kwukwara na ndị ọkaiwu ha amalitela nyocha ya bụ mkpebi iji gwa ha ihe ndị ha kwesịrị ime gbasara okwu a. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba." afirika-43055084,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43055084,Uweojii Israel sị na Netanyahu tinyere aka na mpụ,Ndị uweojii n'Israel sị na onyeisiala ha bu Benjamin Netanyahu kwesiri iza aziza maka ebubo na aka ya dị na mpụ.,"Netanyahu sị na ya kwụsị ike maka ebubo a na-ebo ya bụ asi Ozi ndị uweojii Israel zipụrụ n'akọwa na ha nwere aka ebe goziri na Netanyahu tinyere aka na mpụ na awụwọ n'okwu abụọ. Mana, n'okwu okwuru na ihe onyonyo, Netantahu sị n'ebubo a enweghị atụ, na ya ga-anọdụ ka onyeisiala Israel. Okwuru n'ebubo ndị a ""ama pụta ihe obuna"". Ihe eboro Netanyahu Otu n'ime ebubo a na-akọwa na Netanyahu gwara onye nwe ọlụ nta akụkọ a na-akpọ Yediot Aharonot ka o de akụkọ ga amasi ya. Netanyahu kwere nkwa na ya ga pichi ụlọ nta akụkọ ọzọ so Yediot Aharonot azọ ahia iji kwụhachị ụgwọ mpu a ọchọrọ ka emere ya. Uweojii Israel si na onye isi Yediot Aharonot bụ Arnon Mozes kwesiri iza aziza. Ebubo nke abụọ na-atụ aka na Netanyahụ, bu onyeisiala mba Israel kemgbe afọ 2009, natala onyinye rụrụ nde shekel (naira nde 93840000) na aka Arnon Milchan bu onye na eme ihe nkiri na Hollywood ama ama nakwa ndị ọzọ. Ụlọ nta akụkọ Jerusalem post si na onyinye ndị a bụ mmanya Champagne, Ciga bu ihe enyere Netanyahu maka na onyere Milchan aka weta akwukwọ ojiri ga mba Amerịka. Ndị uweojii n'Israel si na Milchan kwesiri iza aziza maka ihe a." 42965727,https://www.bbc.com/igbo/42965727,Conte: Onye nchịkọta Chelsea anaghị aga ebe ọbụla,Agaghị achụ Antonio Conte n'ọkwa onye nchịkọta otu Chelsea n'agbanyeghi mmeri Watford ji goolu anọ merie ha n'abalị Mọnde.,"Antonio Conte bụ onye nchịkọta Chelsea ebutela nanị otu iko Premier League kemgbe ewere ya n'ọrụ Ekwughi ihe ọbụla gbasara ọkwa Conte ka emerichara ha, ebe onyere ndị egwuregwu bọọlụ ya ụbọchị ezumiike atọ. Akụkọ si na Stamford Bridge na-egosi na onweghi uru ọ bara ma achụpụ Conte ugbua tinye onye ọzọ, maka na Chelsea ka nọ n'ọkwa nke anọ na tebulu premier league, ka na-agbakwa ịsọmpi Champions League na FA Cup. N'agbanyeghi na a na-akwanye Conte ọkụ ugbua, ọgaghị eme ka echefuo na Conte bụ onye nchịkọta nke mbụ ga-erite 'onye nchịkọta nke ọnwa' n'ọnwa atọ nọkọrọ ọnụ (n'afọ Oktoba, Novemba na Disemba) Ndị otu egwuregwu ya ọkwụ ya na-azụ? Onyeisi ndị otu egwuregwu bụ Gary Cahill kwunyere onye nchịkọta ha sị na osighi Conte n'aka, na ndị otu ya kwesịrị 'ile anya n'ugegbe' ka emerichara ha na ụlọ ndị Watford. Ọ sịkwa ""ihe ọ bụla e kpebiri, ndị otu eguregwu nwere ụta n'ime ya Onye nchịkọta a arụọla ọrụ a na-atụwaghị anya"" Onye nche goolu Chelsea bụ Thibaut Courtois kwunyekwara Conte sị ""Anyị kwenyere n'ime ya ma kwenyekwar n'ime otu anyị Anyị emeghi ọfụma ugboro abụọ, mana anyị na-agbalị ịlọghachị, chịkọta ọnụ ma gbawakwa ọzọ"" Nkea bụ mbụ a na-eji ihe ruru goolu atọ merie Chelsea n'usoro nọkọrọ ọnụ na Premier League kemgbe Oktober 1995 Ihe Conte kwuru Oge BBC Redio gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ebe ọkwụ akwụ, Conte kwuru ""ọ bụ otu ihe ahụ. Anọm ebe a, na-agba mbọ irụ ọrụ ma tinyekwa onwe m n'ime ọrụ m. Nkwanyeọkụ? Kedụ nkwanyeọkụ ọ bụ? Gịnị bụ ọkụ a na-akwanye?"" Chelsea buliri iko n'afọ garaaga, nọzị n'ọkwa nke anọ, ebe ndị nọ n'isi bụ Manchester City ji pọintị iri na itoolu aga ha." afirika-48175871,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48175871,Boko Haram Kidnap: Ha na-ana N100m n'isi Abraham Amuta,Ndị a na-eche Boko Haram tọọrọ otu nwoke ji otu afọ efe ala nna aha ya bụ Abraham Amuta nakwa onye ụkọchụkwụ ndị Living Faith na Borno Steeti sị ka akwụọ ha otu nde narị Naịra ka ha were,"Abrahama Amuta hapụ ya bụ nwaamadị. Ndị enyi Amuta sị na ndị Boko Haram a jidere ya izuụka abụọ gara aga ebe ha gara ibunye ndị gbara ọsọ ndụ nrị ma zisakwa ozi ọma, dịka ha kwuru n'akara Twitter ha. Ha sị na ha nọ n'ụgbọala ha na ndi ọzọ mgbe mkpamkpa a kpara. Ya bụ otu nwa nne ya, ji otu efe alanna na Batch B stream 1 dị na Maiduguri, Borno steeti. Ọ bụkwa enyi Amuta aha ya bụ Success Ezeanya bụ onye zipuru ozi a n'akara Twitter sị na o nwere ndị kpọrọ sị na ha bụ ndị otu Boko Haram kwuru na ha ji Amuta eji. Ezeanya rịọrọ n'akara twitter ya sị, ""O ruola izuụka abụọ achọwara Abraham Amuta. Ndị sị na ha bụ ndị Boko Hara kpọrọ n'ekwentị sị na ọ bụ ha tọọrọ Abraham. Biko onye ọbụla zisawa ozi a ka o rụọ ndị isi ọchịchị aka"". Ka Borno sị dị egwu, a na-enye ndị ji otu afọ efe alanna ohere ị sị na ha agaghị aga ebe ahụ. Nke a mere ka ihe ruru narị asatọ mmadụ sị na ha agaghị aga ebe ahụ ife alanna ha kemgbe ọnwa Nọvemba gara aga. Akụkọ ga-amasị gị Abrahama Amuta Ndị e chere bụ ndị Boko Haram tọọrọ otu nwoke na-efe ala nna ya bụ Abraham Amuta. Ndị otu ahụ anaala ego mgbapụta bụ otu nde narị naira n'isi Amuta bụkwa onye ụkọchụkwụ ụlọụka Living Faith na Borno Steeti. Ndị enyi Amuta sị na ndị Boko Haram a jidere ya izuụka abụọ gara aga ebe ha gara ibunye ndị gbara ọsọ ndụ nrị ma zisakwa ozi ọma. Ha sị na ha nọ n'ụgbọala ha na ndi ọzọ mgbe mkpamkpa a kpara dịka ha si kọwa n'akara Twitter ha. Ya bụ otu nwa nne ya mụrụ ji otu afọ efe alanna na Batch B stream 1 dị na Maiduguri, Borno steeti. Ọ bụkwa enyi Amuta aha ya bụ Success Ezeanya bụ onye zipuru ozi a n'akara Twitter sị na o nwere ndị kpọrọ sị na ha bụ ndị otu Boko Haram kwuru na ha ji Amuta eji. Ezeanya rịọrọ n'akara twitter ya sị, ""O ruola izuụka abụọ achọwara Abraham Amuta. ""Ndị sị na ha bụ ndị Boko Hara kpọrọ n'ekwentị sị na ọ bụ ha tọọrọ Abraham. Biko onye ọbụla zisawa ozi a ka o rụọ ndị isi ọchịchị aka"". ka o kwuru. Ka Borno sị dị egwu, a na-enye ndị ji otu afọ efe alanna ohere ị sị na ha agaghị aga ebe ahụ. Nke a mere ka ihe ruru mmadụ narị asatọ sị na ha agaghị aga ebe ahụ ife alanna ha kemgbe ọnwa Nọvemba gara aga. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51450717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450717,Death during sex: Ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị,"A nọkata nọkata a nụ na nwoke nwụrụ n'elu nwaanyị maọbụ na nwaanyị nwụrụ n'okpuru nwoke, mana gịnị na-ebute ya?","Ụfọdụ na-anwụ site n'ume ngwụ, ụfọdụ na-anwụ site na nkubi ume, ụfọdụ na-anwụ site n'ụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Mana ndị ọkammụta sayensị emeela nnyocha ịchọpụta ihe ndị nwereike ibute ọnwụ mgbe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta ahụ. Dkt. Issa Dahabreh nke Tufts Medical Center dị n'obodo Boston, na mba Amerịka, mere nchọpụta na ụfọdụ ndị na-anwụ n'ihu ọrụ n'ihi obi nkoropu. Ọ kọwara na ụfọdụ oge, mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-adị ka mmegharị ahụ nke na-adị ka ahụ gị ọ na-arụsi ọrụ ike; nke a nwereike ime ka mmadụ nwee obi nkoropu ọkachasị ndị na-anaghị emegharịbu ahụ oge ọbụla. Gịnị nwereike igbu gị n'elu nwaanyị? 1) Ịṅụ ọgwụ tupu ị rịa ya elu: E nwere ọgwụ ndị a na-ere maka ụmụnwoke ịṅụ tupu e dina nwaanyị, otu n'ime ha bụ nke a na-akpọ Viagra. Mana ebe ndị dọkịta na-ekwu na ọ bụ nwoke amụ ya anaghị ekelinwu kwesịrị ịṅụ ọgwụ a, ụfọdụ na-akachi ntị ṅụọ ya makana ha chọrọ ka o mee ka amụ ha kwụdosie ike oge ha na-arị nwaanyị elu. Ọ na-abụzị nsogbu nye ụfọdụ ụmụnwoke ọkachasị ndị nwere ọrịa obi (ụfọdụ anaghị ama na ha nwere ọrịa obi), n'ihi na o nwereike ime ka ume ọsọ mewe ha mgbe ha nọ n'ihu ọrụ nke nwereike ibute ọnwụ. Ụfọdụ ndị ọ na-enye nsogbu bụ ndị na-aṅụ ihe karịrị ole ha kwesịrị ịṅụ tupu ha eruo n'ihu ọrụ. Ndị dọkịta na-ekwu ka a ṅụọ naanị otu mkpụrụ kwa ụbọchị n'ime ihe ruru otu awa tupu ị gaa n'ihu ọrụ, mana ụfọdụ na-aṅụ ihe karịrị otu. 2)Ọrịa obi: Dkt McGinger Ibeneme gwara BBC na n'ihi na mmekọrịta nwoke na nwaanyị dị ka ebe mmadụ na-emegharị ahụ ga-eme ka mmadụ na-eku ume ọsịsọ, na o nwereike itinye onye nwere ọrịa obi na nsogbu. O kwuru na onye okporo obi esighi ike nke bụ 'weak artery' na Bekee, na ọbara nwereike gbaruosie ebe ahụ ike nke ga-eme ka nsogbu nwereike ibute ọnwụ dapụta. O kwukwara na oke ọbara ịgbaju n'isi nke bụ 'cerebral haemorrhage' site n'ihe Bekee kpọrọ 'adrenaline rush' nwereike ibute nsogbu oge nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta. Nke bụ na oke ọbara gbajuo, o nwereike ikpachi ebe ikuku ndụ si abata, ọ bụrụ na ikuku ndụ ezughi ọ bụzịkwa ọnwụ na-akụ aka n'ụzọ gị. 3) Mkpọnwụ ahụ: Dkt Ibeneme kwuru na n'ihi etu mmekọrịta nwoke na nwaanyị si atọ, ụfọdụ oge onye nwere ọbara mgbali elu nwereike ịbanye na nsogbu. Ndị ọkammụta kwuru na ọ rakwara ahụ ịhụ ebe mmadụ nwụrụ site na mkpọnwụ ahụ a, mana mmadụ nwereike inweta mkpọnwụ ahụ site na mmekọrịta. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ikwaiko na nwaanyị nọ na nsọ ya anaghị aba Ọgba Ezeagu" afirika-54420265,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54420265,Ejike Mbaka: 'Ndị iro m akpaala nkata igbum ma mechie Adoration ministry',Ụkọchukwu ama ama n'elekọta Adọration Ministry Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka etiela mkpu na ụfọdụ ndịọrụ ya esorola ndị iro ya kpachaa nkata ka ha gbuo ya ma mechie ekpere Adoration na Aqua Rapha.,"'O nweghị onye m na-asọ anya makana chukwu na-eche m'- Fada Mbaka Mbaka malitere tibe ya bụ mkpu kamgbe izu ụka atọ ugbua n'ihi na, dịka o siri kwuo, ọ chọrọ ka ụwa nụrụ olu ya. Mbaka kwara arịrị a n'okwuchukwu o kwuru na ụbọchị Wenezde abalị iri atọ nke Sepụtemba nakwa okwuchukwu ya na ụbọchị ụka, abalị anọ nke Ọkụtoba. O kwuru na ndị iro gbara ya gburugburu, wee rịọọ ndịụka ka ha kpewere ya ekpere n'ihi na ọnwụnwa karịrị ya ahụ. O kwukwara na ya nụrụ ebe a na-agbaizu etu a ga-esi gbuo ya ma mechie ụlọ ekpere ya; tinyekwara ozi ekwentị a na-ezitere ya sị ya kwadowa ọnwụ ya. Mbaka kwukwara na ya agwala gọvanọ Enugwu bụ Ifeanyi Ugwuanyi nakwa ndị uweojii ihe na-eme. O kwuru na ebe ọ nọ na-ewute ya nke ukwuu bụ na ụfọdụ ndị nọ ya nso na ndịọrụ ya so akpa ya bụ nkata. Ejike Mbaka Cheta na n'afọ 2002, mmadụ iri na anọ nwụrụ na Adoration Enugwu, oge ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ndị bịara ekpere. Nke a kpatara ọgbaaghara ji daa, nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị ahụ. Ọzọkwa, Mbaka ekwubuola n'oge gara aga na ndị ekperima wakporo ya ọtụtụ oge ma gbaa ya egbe, mana ọ nwụghị Ọ bụ nke a mere o ji tie egwu dịka nke ọ kpọrọ ""A na-egbu achara, ọ na-eto"" nakwa ""ike m kwo aba mba"" Ihe ruru mmadụ iri na anọ nwụrụ n'ekpere Adoration n'afọ 2002 oge ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ha Ụbọchị ụka gara aga ka Mbaka nọkwa kwuo na aka ndị Uweojii akparala otu nwa okorobia onyeọrụ ya chọrọ igbu mmadụ na Adoration ka o wee konye ya okwu n'isi. Mbaka gwara ndị niile na-akpa nkata ọjọọ ahụ na o nyere ha otu izuụka ka ha chegharịa bịa rịọọ mgbaghara tupu iwe chineke ezute ha n'uju. Mbọ niile BBC gbara iji nụta n'ọnụ ndị uweojii Enugu kpụrụ n'ala makana ma ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Daniel Ndukwe nakwa Kọmịshọna ndị uweojii bụ Ahmad Abdulrahman, azaghị ekwenti ha. Ihe nkiri a ga-amasị gị Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo" afirika-57049659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57049659,Adoration Ministry Enugu Nigeria (AMEN): Ihe mere Rev Fr Ejike Mbaka ji mechie ụka ya ruo otu ọnwa,"Ozi na-erute anyị aka ugbua na-ekwu na-emechiela ụlọụka ""Adoration Ministry"" nke Father Ejike Mbaka bụ onyeisi ya ruo otu ọnwa.","Onye ntaakụkọ BBC gakwara ebe ahụ ma hụ na a gbachịrị ya bụ ogige ofufe dịka akụkọ si kwu. Lee ihe nkiri gosiri ka ebe ahụ dị ugbua. Content is not available End of Facebook post, 1 N'akwụkwọ ozi o wepụtara nso nso a , Mbaka kwuru na a ga-agbape Adoration ministry ọzọ n'ụbọchị June 10 dịka a malitere mgbachị ahụ n'ụbọchị Mee 10,2021. Ọ rịọrọ ndị otu ya ka ha dere duu makana ọ bụ ekpere ka ọ gara ikpe ma na-arịọkwa ha ka ha gaa kpee ekpere nke ha. Onye ntakụkọ anyị kwụkwara na ọ hụrụ ndị otu Adoration ebe ha kwụcha n'akụkụ ụlọụka ahụ ma na-ekiri etu e si gbachie ebe ahụ n'ụtụtụ a. Cheta na Bishop Onaga kwuru ka ndị ụka Katọlịk nọ n'Enugu mee ọpịpịa maka etu ndị otu Father Mbaka si bia mebisie ihe n'ogige Bishop Katọlik nke Enugu. Father Ejike Mbaka arịọla Bishop Onaga na ụka Katọliki mgbaghara Rev. Fr Ejike Mbaka arịọla onyeisi ụka Katọliki n'Enugwu bụ Bishọp Callistus Onaga, nakwa ụka Katọlik n'uwa niile mgbaghara maka ọgbaghara ndị otu ekpere ya mere n'Enugwu n'ụbọchị Wenezde, abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021. Mbaka, onye nwe ụlọ ekpere 'Adoration Ministry', gburu ikpere n'ala rịọọ Bishop Onaga mgbaghara maka ihe niile ndị ekpere ya mebiri n'ụlọ Bishọp dị na Independence Layout Enugwu, nakwa n'ụlọụka Holy Ghost Cathedral dị n'Ogui Enugwu. Ọ rịọrọ mgbaghara a oge ọ na-aka ụka ụbọchi Sọnde, 9 nke ọnwa Mee n'Obi Adoration. Mbaka ji ohere ahụ kwuo na onweghị onye o zipuru ka ọ gaa mebie ihe n'ụlọ Bishọp. Ọ dọkwara ndị ekpere ya aka na ntị ka ha na-erubere ụka katọliki isi mgbe niile. Mbaka kwuru na ya ga na-erubere ụka isi dịka onye ụkọchukwu. O kwuru sị: ""Mụ na Bishọp m anaghị ese okwu, onweghị esemokwu ọbụla dị n'etiti anyị abụọ."" ""Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ itinye esemokwu n'etiti anyị mana ihe dị n'ime m agaghị ekwe ka ọ gaziere ha."" 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo ọrụ 400,000' Mbaka gara n'ihu kwuo sị: ""Anaghị m agba ụka Katọlik mgba. O nweghị ike ime."" ""Ihe niile m nwere bụ ụka nwe ya. Arụọla m ọrụ n'ụka ihe karịrị afọ iri abụọ na ise, gịnị ka m ga-eji bido ịgba ya mgba?"" Mbaka kwuru na ọ bụ ndị ọzọ na-abụghị ndị ụka Katọlik tinyere aka oge ahụ ndị mmadụ na-achọ ya wee mebie ihe na be Bishọp. ""Egburu m ikpere n'ala wee n'arịọ nzukọ Katọlik mgbaghara maka ihe niile merenụ,"" Mbaka kwuru. ""Ọ bụrụ na o nwere ihe m kwuru n'ụzọ adịghị mma, biko gbagharanụ m."" 'O nweghị onye m na-asọ anya makana chukwu na-eche m'- Fada Mbaka Cheta na ụbọchị Wenezde gara aga ka ndị otu Adoration gagharịrị Enugwu mee ngagharịiwe n'ihi na ha kwuru na a tọrọla ụkọchukwu ha bụ Mbaka. Ndị ekpere Adoration ji iwe ahụ gaa kurie ụlọ Bishop Enugwu bụ Callistus Onaga n'ihi na ha boro ya ebubo na ọ ma ihe mere Fada Mbaka. N'ihi nke a, Bishop Onaga tiri iwu ka ndị ụka katọliki n'Enugwu kpee ekpere pụrụ iche ma mee ọpịpịa otu izuụka iji rịọọ Chukwu mgbaghara maka mmetọ ndị ahụ mere ngagharịiwe metọrọ oriri nsọ n'ime ụlọụka Holy Ghost Cathedral Enugwu. Ihe ga-agwọ coronavirus nwereike bụrụ nwa mpe mpe ihe - Mbaka N'oziọma ya n'ụbọchị Sọnde a, Fada Mbaka nyere ndị otu ya niile ntụziaka ka ha sonye kpee ya bụ ekpere nke Bishọp kwuru ka e kpee. Mbaka kwere nkwa na ya na ndị otu ya niile ahụ mebiri ihe ga-aga n'igwe ga rịọọ Bishop Onaga na ndị ụkọchukwu niile mgbaghara." afirika-43327146,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43327146,Ndị dọkịta Naịjirịa enwere ike ịjụ mbuli ụgwọ ka ndị Canada?,Ebe ndị dọkịta Naịjirịa na-ebe akwa na anaghị akwụlite ha ụgwọ ka ndị nke Canada na-ekwu ka ebutuo ụgwọ a na-akwụ ha.,"Ndị dọkịta Naịjirịa agbaala abụbọọrụ ugboro ugboro maka ihe gbasara ego Na Canada, ihe ruru dọkịta 500 na ndị na-amụ ịbụ dọkịta bịakọtara ọnụ depụta akwụkwọ ikwu na ha achọghị irizi nnukwu ụgwọ ọnwa. Ha kwuru na ọ na-akpasu ha iwe na a na-ebuli ụgwọọnwa ha ebe ndị nọọsụ na ndị ahụ na-adịghị na-ata ahụhụ. Ha kwuru na ọ ga-akara ha mma na-etighachịrị ego mara n'elu ụgwọ ọnwa ha n'ime ngalaba ahụike ha. Nke a onwere ike ime na Naịjirịa? N'agbanyeghị na kwa afọ ọtụtụ ndị Naịjiria na-abanye mahadum ịgụ maka ọgwụ na ịwa ahụ nke bekee kpọrọ, medicine and surgery, o meghị ka ọrụ zuoro ha n'obodo a. Nke a kpatara na ọtụtụ n'ime ha na-achọ ụzọ igbaga obodo ndị ọzọ ịchọ ọrụ, ebe ndị nke na-agbafughị na-agba abụbụ ọrụ kwa mgbe kwa mgbe ka a kwụọ ha ụgwọ ma buliere ha ụgwọ ọnwa ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: BBC Igbo jụrụ otu dọkịta aha ya bụ Aliyah ma ọ ga-agbaga obodo ọzọ ma ohere pụta, ọ sị ""A naghị akwụ anyị ụgwọ ọfụma. Ọrụ anyị anaghị enye anyị ọṅụ. Ọ bụ ya mere na anyị hụ ohere iji apụ, anyị ewere ya. ""Ọ bụ ụra n'ihu ndị nọ n'ọchịchị Naịjirịa, ọ kwesịrị ka ha lebanye ya anya. ""Ngalaba ahụike anyị anaghị arụ ọrụ. Ndị nọ n'ọchịchị amaghị ihe ọbụla na-aga. E kwesịrị itinye uchu n'ihe gbasara ngalaba anyị maka na ọbụghị nanị anyị ka o metụtara. Ọ metụtara ndị ahụ adịghị."" Ego ole ka a na-akwụ ndị dọkịta? Aliyah bụ dọkịta na-ahụ maka ọrịa isi mgbaka gwara BBC Igbo na dọkịta ndị na-arụ n'ụlọọrụ gọọmentị ka na-agbagote n'ọkwa na-eri ihe ruru puku naira 150, ebe ndị nọ n'isi na-eriru puku naira 400. Ọ sịkwa na ndị na-anaghị arụ n'ụlọọgwụ gọọmentị anaghị eriru puku naira 150. Gịnị na-eme ndị dọkịta na-eji agbaga obodo ọzọ? Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya" afirika-43634765,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43634765,Akụkọ kachasi n'abalịa: Amatala onye wakporo ụlọọrụ YouTube,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa. Gọvanọ Okezie Ikpeazu : 'Anyị na-agba mbọ ịlekọta ndị ihe mberede okporoụzọ a metụtara',"Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Mgbe BBC Igbo gbara onye Kọmishịọna mgbasa ozi nke Abia Steeti bụ John Okeiyi ajụjụ ọnụ n'ekwe ntị, o kwuru na nke a bụ eziokwu. Okeiyi kwuru na ọ gaarala ezinaụlọ ndị ahụ mgbaru, kwuo na Gọvanọ Okezie Ikpeazu na-agba mbọ ịhụ na ndị merụrụ ahụ na-atara ọgwụgwọ tara ọchịchị. Okeiyi gwara BBC Igbo na nwunye Gọvanọ nọ na oke iri uju, na ọ gaghị enye ohere ị zaa ajụjụ ọnụ mgbe ahụ. Ndị uweojii Enugu Steeti ekwuola na onweghị ụmụnwaanyị awakporo n'Egugu Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu Onye na-ekwuchite ọnụ ndị uweojii n'Enugu Steeti bụ Ebere Amaraizu kwuru na ha enwetabeghị akụkọ n'ụlọọrụ ha gbasara ndị ụmụnwaanyị awakporo n'Enugu Steeti. O kwuru na akụkọ ahụ sina tuwita gbasara mwakpo a bụ okwu asị Amaraizu kwuru na ụlọọrụ ha dị njikere ị na-abata ozi ọ bụla gbasara nke a. Ndị uweojii Kalifonịa akpọla aha onye wakporo ụlọọru YouTube Nasim katọọrọ YouTube n'igwe Webụsaịt ya Ndị uweojii Kalifonịa sị na aha nwagbọghọ ahụ bụ Nasim Aghdam, onye gbara afọ iri atọ na itoolu. Ha kwuru na iwe ya bụ na ọ YouTube na-ehichapụ ihe onyonyo ya, nke mere na-ebelata ego ọ na-enweta. Chọpụta uru Ojị bara n'ala Igbo ebe a:Ị ma uru ọjị bara n'ala Igbo? 'Onye wetara ọjị wetara ndụ' N'akụkọ egwuregwu Ray Wilkins nwụrụ dịka ọgbara afọ iri isii na otu Onye gbara mba England n'akwa otu Chelsea bọọlụ bụ Ray Wilkins anwụọla taa mgbe ọgbara afọ iri isii na otu. Wilkins gbakwara ndị Manchester United, AC Milan, Rangers na QPR bọọlụ. Ndị ezinaụlọ ya kelere ndị enyi maka izibata ozi obiọma ha. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-50513668,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50513668,Landmines: Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe ọbụla n'ogbe gị,Ogbuniwe na ihe mgbawa dị iche iche a kpọrọ un-exploded ordinances (UXOs) bụ ezigbo nsogbu nye ọtụtụ obodo dị na mbaụwa.,"Nke a bụ n'ihi ọgbaaghara, agha, ọgụ na mwakpo na-eme na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa ugbua. Ndị mmadụ na-eji ngwaagha dị iche iche dịka egbe, mgbọ nakwa ogbunigwe bụ nke ha na-atọgbọ n'ụzọ na-amaghị ama. A bịa na mpaghara ọwụw anyanwụ nke Naịjirịa e nwere ogbunigwe ndị dịcha n'ime ala nke e ji lụọ ọgụ Biafra (afọ 1967 ruo 1970). Mana ugbua ndị mmadụ na-arụzi ụlọ nakwa ịkọ ọrụ ugbo n'ebe ogbuniwe ndị a nọ na-amaghị na ụfọdụ ha ka nwere ikike ịgbawa. Ọtụtụ oge ka a na-achọpụta ogbunigwe ndị a n'ala. Na nso nso a ndị uweojii n'Anambra gbawara ogbunigwe achọpụtara n'Ọka. Ya mere akụkọ a bụ iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha mara ihe ha ga-eme ma ha buru ụzọ chọpụta ogbunigwe n'ogige ha. Ụzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma ịchọpụta ogbuniwe n'ogige gị: Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed siri kọwa etu ndị mmadụ ga-eji chekwaa onwe ha ma ha zute ogbunigwe n'ogige ha bụ:" egwuregwu-49051565,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49051565,Killings in Anambra steeti: Nwaokorobịa gburu enyị ya nwoke maka nwaanyị,Ndị uweojii n'Anambra steeti anwụchiela otu nwaokorobịa na enyi ya nwoke bụ ndị gburu enyị ha ọzọ maka nwaanyị.,"Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa Dubem Okeke bụ onye gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) ka a na-ekwu na ọ gbagbunyụrụ enyi ya nwoke bụ Chinedu Okoye anya maka nwaanyị. E jidere Okeke (37) na enyi ya ọzọ bụ Ikechukwu Okafor bụ ndị asị na ha gara n'ụlọ Ifeanyichukwu Kamsisichukwu bụ enyi nwaanyị Okeke kpụpụta Okoye bụ onye rahụrụ n'ụlọ Ifeanyichukwu gba ya egbe. Okeke na Okafor gara kpaa ya bụ arụ n'ụlọ Ifeanyichukwu n'elekere asaa n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde dịka ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị dee n'akwụkwọ o zigaara ndị ntaakụkọ. Haruna dere na "" ama agbaara ndị uweojii Ogidi Division mere e ji nwuchie ndị akpụobi a"". Chinedu Okoye gbara afọ iri abụọ na anọ (24) bụ onye Umuru n'Ogidi, Anambra steeti. Ka a gbachara ya bụ egbe, e bugara Okoye ụlọọgwụ a kpọrọ 'Twinkle' dị n'Ogidi bụ ebe ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọọla. Haruna sị na nchọpụta amalitela n'ọnwụ ya bụ nwaokorobịa ebe ha ji egbe a sị na-eji gbagbuo ya bụ nwaamdị. Ọ sị na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe mgbe ya bụ nchọpụta gachara. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43610268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43610268,Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Anthony Joshua emeriela n'ọkpọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Ndị uweojii Enugwu steeti anapụtala ndị mmadụ egbe karịrị otu narị,"Ndị uweojii n'Enugwu steeti kpokọtara egbe gụnyere AK47, double barrel, nakwa pump action Iji rube isi n'iwu onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere gbasara ịchịkọta egbe dị n'aka ndị nkịtị. Onye kọmịshịọna ndị uwe ojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe niile ndị ahụ, nke o kwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee chekwaa ndụ na akụnaụba ndị ala anyị. Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gụnyere; Ak 47 iri, pump action iri na atọ, pistol otu barrel iri atọ na atọ, double barrel iri atọ na isii, egbe mkpụmkpụ ebere ọnụ asatọ, revolver atọ, baretta pistol iri na otu, egbe ogologo otu barrel iri na asatọ, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụọgụgụ. Uche Secondus na Lai Mohammed na-akwata Onyeisi otu pati PDP bụ Uche Secondus enyela mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed ụbọchị abụọ iji kwugharịa ebubo e boro ya maọbụ ọ gbaa ya akwụkwọ. Mohammed boro Secondus ebubo na ọ natara nde narị abụọ n'ụlọọrụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa n'afọ 2015. Na mba ofesi Mba Russia na ndị nnupuisi n'obodo ọdịda-anyanwụ Ghouta dị na Syria ekwekọrịtala na ha ga-achili aka elu. Aka a ha chiliri elu ga-enye ohere ka e nwee ike si n'obodo Douma bupu ndị merụrụ ahụ ma nwekwaa ike ịga n'obodo ndị ọzọ. N'egwuregwu Nwaafọ Naịjiria na-anọchite anya ndị Britain bụ Anthony Joshua meriri n'ọkpọ 'world heavyweight' ọ kụrụ. Anthony Joshua ji aka ekpe ya kụọ Joseph Parker ihe ọtụtụ oge n'asọmpi ha Joshua meriri Joseph Parker bụ onye New Zealand n'ọkpọ ha kụrụ n'isi ụtụtụ taa. Mmeri a o meriri, nyere ya ihe nrite WBO, nke mere ka o soro na ndị na-akụ ọkpọ nwere ihe nrite WBA, IBF nakwa WBO nke ndị agba heavyweight na mbaụwa. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ụzọ ezi emegharị ahụ Kedụ ndị kwesịrị iyi isiagụ Ishiagụ ọ na-ekwesi ụmụnwaanyị ka ọ bụ nanị ụmụnwoke kwesiri ị na-eyi ya?" afirika-57299021,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57299021,Ahmed Gulak: Etu e si gbagbuo ndị gburu Ahmed Gulak,Ndị uweojii imo steeti ekwuola na ha egbuola ndị ekperima ahụ gburu onye otu APC a ma ama bụ Ahmed Gulak n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde.,"Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti kwuru na ọ bụ n'ahịọ Afor Enyiogugu dị n'Aboh Mbaise ka ndị uweojii na ndị ekperima ahụ kwakọtara mgbọ ebe ha nọrọ zute ọnwụ ha. Ha kwuru na ọ bụ ọkwọ ụgbọala bu Gulak mgbe a gbara ya egbe kọwara udiri ụgbọala ndị omekome ahụ bu bia kpaa mkpa mkpa a. Ha kọwara ụzọ ndị ahụ si gbafuo nke mere ka ndị uweojii ahụ nwuchie ha n'ahịa Afor Enyiogugu dị n'ọkpụrụọchịchị Aboh-Mbaise ebe ha na-ekenye ndị obodo yabasị ha ji ike napụta gwogwolo bu ya. Ha kwụsịrị gwogwolo bu yabasị si ugwu bata n'ike. Ihe anyị ma maka ogbugbu ndị ugwu na Rivas Ndị uweojii kwuru na ha napụtara ndị omekome ahụ egbe karịrị ise nakwa ụgbọala atọ ha ji gaa njem igbu Gulak. Ha kwuru na ndị omekome ahụ ha gbgburu bụ ndị otu Indigenous People of Biafra Ipob nakwa Eastern Security Network (ESN). Etu e si gbagbu Ahmed Gulak bụ onye otu APC n'Imo steeti Ahmed Gulak bụ onye otu APC mabụrụkwa onye ndụmọdụ Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa anwụọla. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Bala Elkana kwuru na ọ bụ n'elekere nke asaa nke ụtụtụ May 30, 2021 ka ndị o ji egbe wakporo ụgbọala bu Ahmed Gulak na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha na-eje ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owerri ị ga-abanye ụgbọelụ. Etu e si gbuo Ahmed Gulak O kwuru na mgbe Gulak na-ahapụ ụlọoriri na mkwarị ya akpọrọ Protea, na o nweghị onye uweojii ọ gwara maka enweghị ezi nchekwa dị n'Imo steeti ugbua. O kwuru na o nweghị ndị ọrụ nchekwa so Gulak nakwa onye 'taxi' bu ya gbara ụzọ ọzọ ebe ndị omekome ruru isii bu ụgbọala kwụsirị ụgbọala ya ma hụ na ọ bụ ya nọ ebe ahụ, gbagbuo nanị ya. Ha gbagburu ya n'ụzọ Umueze Obiangwu dị n'okpuruọchịchị Ngor-Okpala dịketere ọdọ ụgbọelu. Bala kwuru na kọmịshọna ndị uweojii n'imo steeti bụ Abutu Yaro ekwuola ka e mee nyocha gbasara ọdachị a ma zipu ndị uweojii ka gechie ogbe ahụ ma nwụchie ndị omekome ahụ. Ihe ndị ọzọ ịkwesiri ị ma maka Ahmed Gulak Ahmed Gulak chịkọtara ọgbakọ mere ntụliaka ime ụlọ nke Imo steeti n'afọ 2019. Ọgbakọ ahụ họpụtara Hope Uzodimma na-achị Imo steeti ugbua na ntuliaka ime ụlọ APC Imo steeti mere n'afọ 2019. Gulak bụbu onye enyemaka nakwa ndụmọdụ Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa. O si na pati Peoples Democratic Party fegaa na All Progressives Congress n'afọ 2018. Otu nwata nwaanyị ji aha Munerahaag wee nọrọ na twitter depụtakwara ozi a n'akara ya. Na nso nso a, eweghị ezi nchekwa na-arị ibe ya elu na mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka ndị omekome na-emebesi ọtụtụ ngalaba gọọmenti etiti na steeti ahụ. Ọnwụ Gụlak na-abịakwa n'oge ndị nọ na mpaghara ọwụwa na-eme ncheta Biafra bụ ụbọchị onye agha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu kwuputere na Biafra ga-esi na Naịjirịa kewapụta na Mee 30. Akụkọ na-abịa." afirika-45332512,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45332512,Buhari: Okwu 'adịghị ndụ' bụ akaọrụ ndị iro anyị,Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputela na okwu ekwuru na onyeisiala Mba Amerịka kwuru nwereike ị bụ aghụghọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchị na anọghị n'ọkwa ọchịchị kụnyere n'igwe mgbasa ozi di icheiche.,"Trump toro Buhari maka agha o na-ebuso ndị na-eme mpụ na mmerụaka na Naịjirịa. Buhari gara Amerika ị ga-aza oku Trump kpọrọ ya n'ọnwa Eprelu mana ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ ""Finanacial Times"" depụatara na Trump katọrọ ya site na ị kpọ ya onye na-adịghi ndụ. Mana Onye na-ekwuchitere ụlọ ọrụ onyeisiala bụ Femi Adesina kwuru na okwu a nwere ike ị bụ ụgha. ""Okwu a bụ ugha, enweghị ihe eji aka n'okwu a. Onyeọbụla nwereike ị kọ ihe ọbụla sọrọ ya,"" Adesina kwuru nke a in'ihe nkiri ụlọọrụ mgbasa ozi ""Channels"" Trump kpọrọ Buhari oku ka ha wee kpa maka akụnụba ,nchekwa na mpụ na-eme Naịjirịa ""Ebe ndị mmadụ na-achọ ị banye ọchichị, ha ga-emenwụ ihe ọbụla. Ihe ndi mmadu na-ekwu maka okwu a na Soshal midia: @Kayodespeaks kwuru na Trump nwereike ị kwu ya bụ okwu nakwa ya na-akwado ya. @viqtoria009 kwuru na Trump bụ onye eji okwu nzuzu wee mara. @AdamstolaG kwuru na okwu a aghaaghị ị bụ eziokwu makana ọ na-ahụ ihe na-eme n'ala Naịjirịa. Patị akpọrọ PDP kwuru na okwu a gosiri ka ndị isiala mbaụwa niile sị ahụta Buhari. Ha kwukwara na o gosiri na ọchịchị Buhari agbajọla ụmụ Naịjirịa. Okwu a Fianancial times weputara na nzukọ Trump na Buhari nwere n'ọnwa Eprelu abụghị otu na nke Trump kwuru maka Buharị mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị:" 48362217,https://www.bbc.com/igbo/48362217,Building collapse: Lee ka ụlọ arụwara kamgbe afọ 20 si daa n'Owerri,Ndị bi n'akụkụ Amaram ebe ụlọ dara n'Owerri agwaala BBC Igbo na onweghị onye nwụrụ n'ihe mberede a.,"Ndị mmadụ chọpụtara na ya bụ ụlọ anọla afọ iri abụọ tupu ọ daa ụbọchị ahụ. Lee ihe nkiri ọ nọ ebe ahụ wee sete Content is not available End of Facebook post, 1 Mgbe BBC kpọrọ ndị Uweojii nị n'Imo steeti n'ekwenti n'ụtụtụ a, ha kwuru na ha ga-akpọghachị anyị ma gwa anyị ka o si mee. Otu onye n'ime ndị sepụtara isi na ya bụ ihe mberede na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na o si na mpio mapụta mgbe ọ nụrụ ụda gosiri na ụlọ ahụ chọrọ ịdaa . Ndị ọrụ gbata gbata eburula ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ. Ruo ugbua, ndị uweojii ebubeghị ekwenti ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46334076,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46334076,Afrima: Lee ndị otiegwu Naijiria chawara na nturuugo Afrika,Ụmụ Naijiria na-eti egwu gụnyere David Adeleke a mara dịka 'Davido' wara dịka ọnwa na nturugo Afrima nke mere na Ghana.,"Davido nwetara nzere okaibe otiegwu nke afọ a nke a kpọrọ 'Artist of the Year' na mmemme nturuugo ahụ. Peter Okoye, otu n'ime ejima PSquare nwetara nzere 'Best 'Choregrapher of the year' Ebe Folarin Falana a ma dịka 'Falz' nwetara nturuugo 'Best rapper.' Innocent Idibia a mara dịka 'Tuface' nwetara nturuugo 'Best African pop.' Praiz ritere 'Best Artiste inn African R 'N' B.' N'aka nke ọzọ, ọgụegwu a ma n'Afrịka bụ Yvonne Chaka Chaka, nwetara nzere, ""Legendary Award, ebe Sarkodie nke Ghana nwetara ' Best Male artiste in African Inspirational music).' Ndị otiegwu si mba dị iche iche n' Afrịka gbakọrọ na Ghana n'ụbọchị Satode maka mmemme Afrima bụ nturuugo na- akwanyere ndị otiegwu si Afrika ezi ugwu maka aka ọrụ ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47437851,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47437851,Sanwo-Olu ka anyị ma - Ohaneze Ndigbo Lagos,"Otu Ohaneze Ndigbo nke mpaghara Legọs, ekwuola na ha kwụ Babajide Sanwo-Olu n'azụ maka ịzọta oche dịka aka na-achị steeti ahụ.","Ihe anyị jiri gwa Ndigbo na Legos tụnyere Sanwo-Olu- Ọhaneze Ndigbo Legọs Solomon Ogbonna bụ onyeisi ha, kwuru na ndị Igbo bi na Legọs na-akwado ya makana ọ bụ onyendu ga-enye ha ihe ha chọrọ ma bụrụ onye ha nwere ike ịtụkwasị obi. Sanwo-Olu mechara kelee ha maka ịnabata ya n'etiti ha. Mnwereonwe Biafra abụghị ikwe ọnụ ahịa - Ipob Otu na-achọ mnwereonwe Biafra na Naịjirịa bụ Ipob ekwuola na ọ gbasaghị ha onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Mee na ọgwụla mwereonwe Biafra bụ ihe ka ha mkpa. Odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Emma Powerful kwuputara nke a ma kọwaa na mwereonwe Biafra abụghị ihe a na-ekwe ọnụ ahịa. N'ofesi Mba China ebola mmadụ abụọ ndị Canada ha nwụchiri ebubo inyocha ha n'ụzọ n'ezighi ezi nke a na-eche bụ ha imegwara na nwuchi Canada nwuchiri nwafọ ha bụ Meng Manzhou. Nke a emeela ka mmekọrịta dị n'etiti mba ndị a bụrụ zie ihe na-akụ ilu. N'egwuregwu Onye nlekọta Gareth bale na-agbara Real Madrid bọọlụ akatọọla emo ndị nkwado Real Madrid kwara Bale ma kwuo na ọ bụ ihe ihere nye ha. Nke a mere n'oge ewepuru Gareth Bale site n'asọmpi ha na Barcelona gbara na Satọde. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mmebi okpommanụ na Bayelsa Ndị uweojii kwuru na enweghi onye nwụrụ mana ọtụtụ ndị mmadụ ahapụla ụlọ ha gbalaga ka okpommanụ agbịdị gbariri na mpaghara Nembe dị na Bayelsa steeti. N'agbanyeghị na ihe a mere na Fraịde, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Bayelsa bụ Asinim Butswat, gwara ndị ntaakụkọ na ha amabeghi ma ọ bụ ndị omekome wakporo ya ka ọ bụ ihe mmebi butere ya. N'ofesi, Ndị agha mba Izrel gbagburu mmadụ abụọ a na-enyo na ha bụ ndị Palestịne ma merụọ otu ahụ ka ndị ahụ bu ụgbọala ha nyakpuo n'etiti ebe ha bụ ndị agha nọ. Ha ekwubeghi maka ọnọdụ ndị otu ha ụgbọala ahụ suru. N'egwuregwu, Enweghi onye meriri ibe ya ka Liverpool na Everton zutere n'abalị. Nke a mere ka Manchester City ka kwụrụ ọtọ dịka eze n'elu tebulu na Premier League. Ihe nkiri ga-amasị gị: Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere" afirika-49767407,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49767407,National Live Stock Transformation Programme: Atụmatụ a abụghị Ruga - Ọnụ na-ekwuru Umahi,Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-enwe mgbagwoju anya n'atụmatụ ịzụ anụmanụ nke gọọmentị etiti na-achọ ihiwe site n'aka osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo.,"E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo Atụmatụ a bụ nke a kpọrọ ""National Live Stock Transformation Programme"" (NLST) ka ndị Naịjirịa na-eche na ya na nke Ruga bụ otu ihe. Cheta na gọomentị etiti wezụgara Ruga mgbe ka ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị ọwụwa anyanwụ, gbarụrụ ihu maka atụmatu ahụ. Mana Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi, dịka onyeisioche kọmitii ndị isiochịchị bụ NEC n'ịcha hopụtara maka ịchị ehi, kọwara ndịiche ya na Ruga. Site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Emma Uzo, Umahi kwuru hoohaa na atụmatụ ""National Livestock Transformation Programme"" abụghị Ruga. Gịnị bụ 'National Live Stock Transformation Programme' a? Emma Uzo gwara BBC Igbo n'ekwentị na atụmatụ a bụ iji nyere ndị chọrọ ịzụ anụmanụ dịka ehi, ewu, atụrụ na ndị ọzọ aka. Onye ọbụla, maọbụ steeti ọbụla chọrọ ịzụ anụmanụ nwereike ịgbaziri ego n'aka ụlọakụ etiti site n'atụmatụ a. Ha ga-eji nwaayọ na-akwụghachị ụlọakụ etiti ụgwọ ma ọ bụrụ ha zụpụta anụmanụ ndị a ma ree ha. Maazị Uzo gara n'ihu kwuo na ọ bụghị iwu na steeti ọbụla ga-eme ya kama na ọ bụ steeti ndị chọrọ ga-eme ya. Cheta na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo gbapere mmalite atụmatụ a n'Adamawa Steeti n'ụbọchị 10 ọnwa Septemba, 2019. Atụmatụ a a sị bụ iji wulite ọzụzụ anụmanụ na Naịjirịa ga-amalite na steeti asaa gụnyere Adamawa, Benue, Kaduna, Plateau, Nasarawa, Taraba na Zamfara. Na nzukọ ndị NEC mere n'ụbọchị 19 Sepụtemba 2019, ha mpụtara ego dị otu narị ijeri naịra maka ya. Gịnị bụ Ruga? Atụmatụ Rural Grazing Area (RUGA) bụ nke onyeisiala Buhari wepụtara n'ọnwa Mee afọ 2019. Maazị Uzo sịrị na ọ bụ iji kwụsị nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi bụ nke tarala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa. Atụmatụ a bụ iwepụta oke ala na steeti ọbụla bụ ebe ndị na-achị ehi na ehi ha ga-ebi dịka a na-azụ ha. O kwuru na a ga-ehiwe ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ. okporoụzọ, ụlọọgwụ ụmụanụmanụ, ụlọahịa na ihe ndị ọzọ ga-enye aka. Ọtụtụ ndị mmadụ karịsịa ndị bi na mpaghara ọwụwụanyanwụ gbarụrụ ma katọọ ihu atụmatụ a. Ha boro ebubo na ọ bụ ụzọ onyeisiala Buhari chọrọ iji kpọbatajuo ndị ọchị ehi na steeti dị iche iche. N'ihi oke nkatọ a mere ka onyeisiala Buhari ji kwụsị atụmatụ RUGA n'ọnwa Julaị 2019. Akụkọ ndị ga-amsị gị:" afirika-43187339,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43187339,Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa,Ndi agha Naịjirịa nọ na-ebuso ndị ọmekataraihepụụjọ a na-akpọ Boko Haram agha na ọwụwa anyawụ ugwu Naịjirịa na-akọwa na ha gburu ndị Boko Haram ise na ọhịa Sambisa.,"Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Onye bụ osote onye na ekwuchitire ndị agha Naịjirịa na ngalaba nke 'Operation Lafiya Dole' bụ Kọnel Onyeama Nwachukwu kwuru na Maiduguri na ndị agha Naịjirịa nọ ọrụ na Sambisa nwụchịkọrọ otu onyeisi Boko Haram ma tọhapụ mmadụ atọ ha jị eji. Ihe ọzọ ndị agha jidekwara bu ụgbọala na nnukwu egbe na mgbọ ndị Boko Haram jị akpa ike. End of Twitter post, 1 Ha gbukwara ndị agha Boko Haram ụfọdụ mgbe ha na ekpocha ọdọ Boko Haram ha kpọrọ 'Sabil-Huda' di n'ime ọhịa Sambisa. Konel Nwachukwu kwuru na ndị agha Naịjirịa abụọ merụrụ ahụ ka ha nọ ọrụ a. Nwachukwu sị na ndị agha Naịjirịa bidoro ịbuso ezumezu Boko Haram akpọrọ 'CAMP ZAIRO' agha nke a na Frịde, agbanyeghị na ogbunigwe ndị Boko Haram niri n'ala mebiri ụgbọala ha ji alụ ọgụ ahu. Konel Nwachukwu kwuru na ha nwetere otu ogbaatumtum, igwe abụọ, ọkọrọtọ Boko Haram ato, igbe ise nri oka di n'ime ha, egbe AK47 otu, na ihe ndị ọzọ dị icheiche. Ndị nwe ụmụakwụkwọ Boko Haram nwụchịkọrọ sị na ndi na efu dị mmadụ otu nari na ise. Cheta na Boko Haram na akpa ike na gburugburu ọwụwa anyawụ dị icheiche. Na ịzụụka gara aga, ha wakporo ụlọ akwkwọ dị na Dapchi na Yobe steeti we nwụchịkọrọ ihe ruru ụmụakwụkwọ otu nari na ise." egwuregwu-44507974,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44507974,World Cup 2018: Kroeshia agbatuola ugo Naịjirịa,'Super Eagles' Naịjirịa zutere Kroeshia n'asọmpị mbụ ha n'Iko Mbaụwa nke Rọshịa 2018.,"Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu Cheta na ọtụtụ mba ndị ọzọ, ma ndị tozuru ma ndị etozughị na-akwado otu Naịjirịa n'ihi na uwe ha masiri ndị ahụ. Ha gbara n'ọgbọ egwuregwu nke Kalininigrad na mba Rọshịa. Balogun merụrụ ahụ gbara ya ọbara n'imi na nkeji 23 nke agba nke mbụ ebe Rakitic ritere akwụkwọ edo na nkeji 30 Ka o ruru nkeji 32 ndị Kroeshia ritere otu ọkpụ n'aka Etebo mgbe bọọlụ ọgbahielu bara n'ime neeti Naịjirịa. Kroeshia gbanwere ndị ọgba bọọlụ site n'iwepu Kramaric tinye Brozovic ebe Ighalo nwara ị ji isi tinye ọkpụ na neeti ha. Iwobi pụrụ ezumike n'elekere 63 ka Musa banyere ị nọchị anya ya. Super Eagles na-anwa na-agba a, ha kwalitere ị ji bọọlụ ha rue pesentị 47 site na 31 n'agba nke mbụ. Troost-Ekong eritela akwụkwọ edo n'aka ogbu opi maka etu o si jichie onye ọgba bọọlụ Kroeshia bụ Mandzukic ebe ha na-azọ bọọlụ n'elu. Nke a butere ndị Kroeshia penariti ha jie mezuo ọkpụ ha gbara Naịjirịa abụọ. Mgbe nke a mere, ndị mmadụ gosiri foto a na-ekwu na ọ dị zị n'aka ndị ị zopụta Naịjịrịa Na mgbakwunye oge, Rakitic na-akpa ike n'otu Kroeshia ritere ohere ị gba bọọlụ nke a kpọrọ 'Free kick' mana ọ mịtaghị goolu. Kovacic nwara na nkeji 90+2 mana e gbochiri ya. Ya mere na Kroeshia jiri ọkpụ abụọ merie Super Eagles ndị Naịjirịa." afirika-47408746,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47408746,Rochas: Ọkwa Sinetọ nwere ike ifunahụ Okorocha - Ọkaiwu,Ọkaiwu Anthony Okah kọwara BBC Igbo aka mgba chere gọvanọ Rochas Okorocha n'ihu n'ihi nsogbu ya na pati ya bụ APC na-enwe.,"Okah kwuru na nke a nwereike ime ka ọkwa Sịnetọ funahụ Rochas ma ọ bụrụ pati APC chụpụ ya n'otu ha. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na APC chọrọ ịta ndị dara iwu ya ahụhụ, na ha kwesiri ịmalite n'ebe onyeisiala Buhari nọ maka na o so daa iwu site n'ịnabata nkwado ndị pati ọzọ. Okorocha's suspension: Ọkwa Sịnetọ nwereike ifunahụ ya - Ọkaiwu Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha ebola onyeisi oche pati APC ebubo ịkpa nkata mere eji kwụsị ya na ndị ọzọ iso pati APC. N'ehihie ụbọchị Fraide ka okwu pụtara na APC achụọla Rochas Okorocha nakwa ogbo ya Ibikunle Amosun. APC kwuru n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na ọ bụ maka na ha kpara agwa megidere pati ha nke Bekee kpọrọ ""Anti-party activities."" N'ọsịsa ya nke dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemeodo binyere aka, Okorocha kwuru na Oshiomhole na-agbasi mbọ ike ime pati APC n'Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria. Okorocha onye boro Oshiomhole ebubo ịhazi ntuliaka ime ụlọ wuruwuru n' Ọwụwa-Anyanwụ kwuru na ịchụpụ ya na pati nọ n'ọchịchị bụ iji nkata kuru mmiri. Okwu Uche Nwosu ""Ebumnobi Adams Oshiomhole site n'ụtụtụ bụ ikposa APC na mpaghara ọwụwanyanwụ."" ""Na mpaghara ọwụwayanwụ, e nwere ọgbaghara n'ihi ntuliaka wuruwuru ọ haziri."" Ọ gara n'ihu kwuo ""Oshiomhole ịchụpụ m na APC bụ n'ihi egwu na Chineke n'obi ebere ya nwere ike ịkpọga m n'ụlọomeiwu ukwu."" Ndị imeobi APC chụtukwara n'ike maka ịkpa agwa megidere pati ha gụnyere Mịnịsta na-ahụ maka Niger Delta bụ Pastọ Usani Uguru Usani nakwa onyeisi Voice of Nigeria (VON), bụ Osita Okechukwu. Ndị imeobi APC nwere mkpebi a ụbọchị Fraide n'ọgbakọ ha nwere n'isi ụlọọrụ APC dị n'Abuja nke onyisioche ha bụ Adams Oshiomhole nọ n'isi ya. Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha Ndị niile BBC kpọtụrụ ịmanye ọnụ n'okwu a na-ekwu na ha anụghị maka ya. Ha gụnyere Ebere Nzewuji, Sam Onwuemeodo nakwa onyeisioche pati APC n'Imo bụ Dan Nwafor. Ibeawuchi Okorocha na Amosun zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu n'okpuru APC mana ha na-akwado ndị mmadụ anọghị na APC maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-abịa. Rochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe" egwuregwu-43715740,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43715740,Man City ọ ga-atọ onwe ha n'agbụ taa?,"N'ime otu izuụka, ndị Man City ahụtala ezigbo ọdịda n'ogo akụ m bọọlụ haa dịka ndị Liverpool na Man United meriri ha n'asọmpi.","Man City na-atụ anya imeri Liverpool iji gafe agba ọkara ikpeazụ n'asọmpi Uefa champịọns Mana ha nwere ohere ịtọpụ onwe ha n'agbụ ọdịdị n'abalị mgbe ha ga-ezute Liverpool ọzọ. Liverpool jiri ọkpụ atọ chara acha merie ndị Man City n'ụkwụ mbụ n'asọmpi Uefa champịọns. Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru uche ha ebe a; End of Twitter post, 1 Onye ntuziaka ndị otu ahụ bụ Pep Guardiola ekwuola na ga-agba bọọlụ 'zuru oke' iji nweta mmeri n'asọmpị ahụ. O kwuru na ọ ka kwesiri ike na ndị otu ya nke ""pụrụiche"". ""Otu ụzọ eji agba bọọlụ dị nma bụ inwe obi dị mma,"" dịka o kwuru. ""Ị gafe, ikwesiri ịgba bọọlụ zuru oke, wepụta ohere, hapụ itufu ohere dị ukwuu, anyị kwesiri i chekwa ohere ndị anyị nwetara nkeọma. Anyị nwere nkeji iri itoolu, ihe ọbụla nwere ike ime, ihe anyị ga-eme bụ ịgbalị,"" Guardiola kwuru. N'aka nke ọzọ otu AS Roma ga-ezute ndị Barcelona, iji megwara ihe ndị Barcelona mere ha n'ụkwụ mbụ site n'inye ha ọkpụ anọ asatara otu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54111128,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54111128,Ihe asatọ ndị agbụrụ ọzọ kachasị jiri mara ndị Igbo na nke bu eziokwu,"Ndị Igbo bụ ndị na-asụ asụsụ Igbo bụ ndị e nwere ike ịhụ na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwụ; Abịa, Anambara, Ebonyi, Enugwu na Imo steeti.","Ha nọkwa na mpaghara ụfọdụ na Delta, Rivas, Benụwe, Kogi, Edo nakwa ebe ndị ọzọ. Mana ebe ọbụla ha nọ, ndị agbụrụ ndị ọzọ nwere ihe ndị ha jikara atụnyere ha n'agwa, ejije nakwa omenala. Anyị jụrụ ndị mmadụ ma ndị Igbo na ndị agbụrụ ọzọ ihe ha na-anụkarị maka ndị Igbo, lee ụfọdụ ihe ndị ha rụtụrụ aka nakwa ihe anyị chọpụtara maka ya: 1. Ndị Igbo hụrụ ego n'anya nke ukwu Ihe bụ ihe mbụ ị ga-anụ maka ndị Igbo na mpaghara dị iche iche na Naijiria. Nke ahụ bụ n'ama, a batakwa n'ụlọ, ọtụtụ ndị Igbo na-ekwukwa ""Igbo ahụka ego n'anya."" Nke bụ eziokwu: Okammuta nkụzi Igbo na mahadum Legọs bụ Chigozie Nnabuihe sị na ya bụ okwu bụ""mkparị"" n'ihi na o nweghị agbụrụ ọbụla kpọrọ ego asị. Ọ sị na ndị Igbo kama ịrịọ arịrịọ nwere ike ""ịma mmiri, maa anwụ iji kpata ego"" . ""Onye Igbo bụ onye e ji ịgba mbọ mara. Ọ na-agba mbọ ịkpata nke ọ ga-eri, nke ọga-eji nyere nne na nna ya na ọha izugbe aka."" ""Ọchọ-nke-ya-enwe-iro bụ ihea e ji enye Igbo mkparị ahụ."" 2. Ndị Igbo nwere nka azụmahịa Otu Ahịa Ahịa dị na Legọs Ihe ọzọ ọtụtụ ndị mara ndị Igbo bụ azụmahịa. Ha na-ekwu na ụmụ Igbo chị ọkụ n'azụmahịa. Ọ na-agba ndị mba ọzọ gharịị etu onye Igbo nwere ike ịbata obodo na enweghị ihe ọbụla karịa obere ngwaahịa mana e nye ya oge ọ tụtụjuo akpa ya. Ọtụtụ na-eji ya ama ndị Igbo njakịrị na onye Igbo nwere ike iresị ndị Eskimo akụ mmiri igwe. Nke bụ Eziokwu: Ịzụ na ire ahịa mara ndị Igbo ka ego mara Ojukwu. Nke mere ọ bu ha bu ọka ibe n'Ahịa Ọnịcha, Arịrịa Aba, Mgbuka Nnewi, Nkwo Igbo, Ogbete Enugwu, Alaba dgz. Nka azụmahia esorola Igbo pụọ ala Igbo gawa mpaghara ndị ọzọ na Naijiria nakwa ofesi. I legharịa anya, n'otụtụ ebe, ụfọdụ ndị Igbo na-azụ ahịa e sila na inweta ọdọahịa ebe ha na-akwụ ụgwọ, tiwaa ịzụrụ ebe ọ na-ere ahịa maọbụ iwu ahịa. Na Legọs, ahịa dịka Idumota, Ladipo, ebe a na-ere mkpụka na International Trade Fair nke a makwa dịka ""ASPAMDA"" (Auto Spare Parts & Machinery Dealers Association) bụ ọgbọ ahịa ndị Igbo juputara. 3. Ndị Igbo anaghị ekwe ka nwaanyị ha lụọ ọrụ Bekee Ụfọdụ ndị abụghị ndị Igbo na-ahụta ndị igbo dịka ndị anaghị ekwe ka nwunye ha chakee n'ọrụ bekee n'ihi egwu na nwaanyị ria n'ọkwa n'ọrụ Bekee ọ ga-akarị di ya maọbụ ọ ga na-agba n'ezi. Nke bụ eziokwu: Nnabuihe kwuru na ọ bụghị eziokwu. Ọkaiwụ Dorothy Oleka kwuru na ""Ngụkọ goziri na Ndị Igbo kachasị nwee ụmụnwaanyị nọ na di na-arụ ọrụ Bekee"". 4. Ụmụnwaanyị ha na-agbakarị ajị n'obi nakwa n'iru ma nwee ji n'ụkwụ ha Ụfọdụ ndị abụghị ndị Igbo na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo na-enwekarị ajị n'ahụ ha ọkachasị n'ihu nakwa n'obi ma na-enwekwa 'mba ji' n'ọkpa. Nke bụ eziokwu: Otu dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Dọkịta Joseph Akinde kwuru na ọ bụ eziokwu mana ọ gbara ama na ọ bụghị naanị ụmụnwaanyị Igbo, na ndị si mpaghara Cross Rivers nakwa ụfọdị ndị Yoroba na-enwekwa oke ajị. Akinde, onye nwee Ụlọọgwụ Living Spring dị na Legọs sị; ""Ihe mere ụfọdụ ji enwe ajị bụ na ha nwere mmiriahụ (hormone) nke nwoke bụ 'protesterone' rinne n'ahụ ha."" 5. Ndị Igbo na-amụ oke ụmụ Ọmụgwọ bụ ọmenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua Nke bụ eziokwu: Ọkammụta Chigozie Nnabuife kwuru na ""ndị Igbo huru nwa n'anya karịa ihe ọbụla ọzọ bụ eziokwu."" ""N'ala Igbo, a na-alụ nwaanyị n'ala Igbo, ihe ana-ajụ bụ ""ha na-amụkwa ụmụ"" Ọ kọwara na mpaghara Mbaise, a lụụ nwaanyị ọ mụọ ụmụ iri, e gburo ya ewu ukwu. ""Ndị Igbo kwere n'ụwa ebighi ebi. A mụọ gị, ịmụta onye ọzọ."" Mana ọ gara n'ihu kọwaa na ọnọdụ akụnaụba obodo, agbanwewala nke a. 6. Ndi Igbo bụ ndị oke amamihe 7. Ego nwaanyị ha na-adị nnukwu elu Ihe ọzọ a na-ekwu maka ndị Igbo bụ na ha na-ana oke ọnụ ahịa na ịlụ nwaanyị, Nke bụ eziokwu: Ọnụ nwaanyị dị iche site n'otu obodo Igbo gaa na obodo ọzọ. Ebe ụfọdụ sị mpagha ụfọdụ dịka Mbaise, Owere bụ ndị e ji imefu ego na agbaka isi were mara , ụfọdụ ndị ọzọ nwere nkwenye na ọ bụ ebe aka ruru nwaanyị ka ọ na-ekonye di ya. 8. O nweghị mba Igbo anọghị Etu m ji si Mbaise bụrụ 'Minister ikpe nkwụmọtọ na Canada – Kaycee Madu Ụfọdụ na-eji ya ekwu okwu sị, ịbata na mba, ịhụghị onye Igbo, gbawa ka ụkwụ gị ha. Nke bụ eziokwu: Ndị Igbo bụ ndị njem. Ha gbasara ka akwụkwọ ụkpaka n'ụwa dum dịka ha na-achọ ebe azụmahịa, nka, mmụta na ọganihu. Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium Ọtụtụ ka na-achakeekwa ka ọnwa ebe ọbụla ha nọ. Nkwenye ndị Igbo bụ na njegharị ka nwa mkpị jị mụta ịsọkali imi elu. Roxy Ogechi Ndebumadu nwada Igbo bụ onyeisi okpuruọchịchị Bowie n'Amerịka Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" mba-uba-43085670,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43085670,Elekshion US 2016: Anwụchiela ndị Russia kpatọsiri aka,"Anwụchiela ndị Russia ruru iri atọ maka aka ha kpatọsiri na mbinye aka US mere n'arọ 2016,nke a chọpụtara na nyocha FBI.","Mbinye aka emere na US n'arọ 2016 wetere ọtụtụ ndọrọndọrọ. Mmadụ na atọ akpọrọ aha ka eboro ebubo ikpa nkata mpu ekwenti akpọrọ 'wire fraud' n'olu oyibo. Onye kwupụtara ihe a bụ onye ọkaiwu Robert Mueller,onye nke na-enyocha nkpatọsị aka ndị Russia. Ụlọọrụ atọ dị na Russia so na nrụrụaka. Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu,osote ọkaịwu akpọrọ Rod Rosenstein kwuru na onweghị ebubo na onye mba Amerika so na ihe nrụrụaka a maọbụ ebubo gosiri na nkpatọsịaka a mebiri ihe mbinye aka US elekshion 2016 pụtara. Mana o kwuru na akwụkwọ ruru pejii iri atọ na asaa gosiri na ndị Russia chọrọ ikụnye mkpụrụ nhasa na mba Amerika. kedu ihe ebubo a putara? Ebubo a kwuru na ụfọdụ ndị eboro ebubo ji kọmputa na US we zoo na ihe omume ha si na Russia. okwukwara na ndị a eboro ebubo jiri aghụghọ gbanwe ọnọdu ha dika ndị si na mba US,mepe pejii n'igwe okwu ọhụrụ ka ha we dọta ndị mba US. Ha mepekwara ma na-elebanya na ọtụtụ igwe okwu twita edoziri ka ọ dika ọbụ ndi US na hazi ya." afirika-50232911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50232911,Social Media Regulation: Kedu etu gọọmentị ga-esi chikọta ma hazie Soshal Midịa?,Gọọmentị Naijiria amaala ọkwa na ọ dị mkpa ka ahazie ma chikọta soshal midia iji kwụsi ịbụsa akụkọ ụgha na ọkwụ ịkpọ asị.,"Mana ọtụtu ndị Naijirịa gbarụrụ ihu n'ihi nke a. Kama enwere ụfọdụ mba hiwere iwu ha ji achịkọta ma na-ahazi Soshal Midịa. Mba ndị a gụnyere: Jamanị Mba Jamanị hiwere iwu nke ha kporọ 'NetzDG' n'afọ 2018 nke gbasatara ụlọọrụ soshal midia niile nwere mmadụ nde abụọ. Iwu a nyere ikike na ụlọorụ ndị a nwere elekere awa iri abụo na anọ iwepụ ihe ọbụla na-ezighi ezi. Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ gọọmenti nde Euro iri ise (€50M). Ebe mmadụ daara ya bụ iwu ga-akwụ nde Euro ise (€5M). Yuropian Yuniọn Iropịan Yuniọn megidere mgbasa ozi ndị oyi egwu na Soshal Midịa Ndị Yuropian Yuniọn gbagidere ụkwụ imegide ibusa akụko ma ọ bụ ihe onyonyo ndị oyi egwu. Dịka iwu ahụ sị kwuo, ụlọọrụ ọbụla na-ewepụghị ihe ngosi ma ọ bụ akụkọ oyi egwu n'ime otu awa ewepụtara ya ga-ata ahụhụ. Ọstrelia Mba Ọụstralịa nwere iwu maka nchịkọta Soshal Midịa Mba Ọstrelia nwere iwu megidere ndị ụlọọrụ soshal midịa niile hapụru akụkọ ma ọ bụ ihe onyonyo gosiri mkpagbụ na ọgbaaghara. Ọ bụru na ụlọọru ndị a ewepụghị akụko di otu a, ndịisi ụlọorụ ahụ ga-aga nga ihe ruru afọ atọ. Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ nha ga-eru ọkara pacenti iri n'ime uru ha nwetere n'otu afọ n'ụwa niile. Rọshịa Rụshịa nwere ikw intinye iwu dịka nke ndị Jamanị Mba Rọshịa nwere iwu na ihe niile gbasara ndị mba Rọshịa ụlọọrụ soshal Midịa ndị a jị arụ ọrụ agaghị esi Rọshịa pụo. Rọshịa na-atụanya itinye iwu yiri nke ndị mba Jamanị. Chaịna Mba Chaịna nwere Soshal Midia nke ha Chaịna machiri Twitter, Google na Whatsapp na obodo ha niile. Ha ji Sọshal Midịa nke ha bụ Weibo, BAidu na WeChat nọchie ha. China nwere igwe mmadụ na enyocha soshal mịdịa ịchọpụta akụko na ozi iwu ha megidere. Kedu ihe ndị Naijirịa nwere ikwu maka nke a Ndị Naịjirịa ji Soshal Midịa agbasa ozi Onye ọkammụta ihe gbasara mgbasa ozi na ịntanetị bụ Kelechi Nwosu kọwapụtara sị: Lee ihe ndị Naijiria na-ekwu na Twitter Otutu ndị dịka @Engr_Henry20 anabataghị iwu ga-emegide soshal Midịa, ọ kwuru sị Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke" 45463848,https://www.bbc.com/igbo/45463848,MASSOB: Anyị kwụ Bianca n'azụ - Uwazuruike,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa taa: MASSOB akwadola Bianca Ojukwu,"Ojukwu lụrụ Bianca n'afọ 1994 Onyeisi ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike ekwupụtala nkwado ya n'ebe nwunye Ojukwu bụ Bianca Ojukwu nọ n'ịzọ ọkwa Sineti ndị Anambra Saụt. Uwazuruike sị na ọ mere nke a n'ihi mmekọrịta dị n'etiti ya na Odumegwu Ojukwu mgbe ọ ka nọ ndụ. Kwụsịnụ inyocha ọbaego ndị mmadụ - Idris @PoliceNG_PCRRU Onyeisi ndị uweojii bụ Idris Ibrahim n'iji chekwa ugwu ruru ndị oweojii na Naịjirịa, adọọla ndị ọrụ nchekwa FSARS aka n'antị ka ha kwụsị enyocha ọbaego, ekwentị nakwa igwe kọmputa ndị mmadụ na anataghi ikike n'ụlọikpe. Idris kwuru na ọnye ọbụla mere nkea ga-achọrọ ụzọ ụla. Akụkọ si mba Sudan Mmadụ iri na itoolu anwụọla mgbe obere ụgbọelu bụ ndị mmadụ sọbara isi n'ime mmiri dị na mpaghara ndịda Sudan. Naanị mmadụ anọ gụnyere ụmụaka abụọ zọrọ ndụ, ebe onye Bishọp ụka Angịlịkan so na ndị nwụrụ anwụ. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ mba Libya bụ Adel Amrouche arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka ikwu na ha ji ọgwụ agba bọọlụ. Amrouche kwuru na ọ bụ egwuregwu ka ọ n-ekwu mgbe o kwuru okwu ahụ. Nkeji abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala Ndị agha Naịjirịa eweela iwe ọkụ Ndị agha Naịjirịa eforola ntutu taa na oge erula mgbe ha ga-akwụsị ogbugbu ndị mmadụ nke ndị ọchịehi na-egbu na Platu steeti. Ndịagha Naịjirịa kwuru na ọ bụ ndị na-alụ ọgụ Operation Lafiya Dole gbapụtara ndị a Onyeisi agha a kporo operation safe Haven bụ nke a na-eme na mpaghara ahụ bụ Major General Augustine Agundu kwuru na o zuola. Naịjirịa Nwa Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu bụ Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu Jr. ekwuola na nsogbu ha nwere ebe nwunye nna ha bụ Bianca nọ bụ na o were akụnaụba nna ha, ya kpatara ha agaghị akwado atụmatụ ya ịzọ ọchịchị. Ojukwu lụrụ Bianca n'afọ 1994 Agbanyeghi nsogbu ndị a, ndị ihe Bianca na-amasị agbarala ya akwụkwọ ịzọ ọkwa sineti n'Anambara Saụt n'okpuru pati APGA. Akụkọ mba ofesi Mba Nọt Koriya emela mmemme ndị agha ebe oro ruru afọ iri asaa e kewapụtara ya bụ mba a na-akpọ Democratic People's Republic of Korea. The military parade appeared toned down following a summit between Kim Jong-un and Donald Trump Ndị mmadụ na-elele ya bụ mmemme ka a mara ka a ga-ahụ ngwọagha nuklia ọbụla mana o nwebeghi nke a hụrụ. N'egwuregwu, Naomi Osaka bụ onye mba Japan emeriela Serena Williams n'asọmpi US open. Naomi Osaka n'aka ekpe bere akwa oge a na-enye ya nturuugo ya Nke a bụ mbụ onye mba Japan na-enweta ụdị mmeri ahụ mana Serena Williams bụ onye Osaka na-elegara anya were oke iwe oge ha na-asọmpi ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-53551243,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53551243,Kaduna: Mgbe ọgbaghara a bidoro na ihe gọọmentị merela,"Mpaghara ndịda Kaduna steeti abụrụla ebe e ji ọgbaghara mara dịka akụkọ na-ekwu na mmadụ iri isii na atọ ọzọ nwụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị, 2020.","Ugbua, ọ na-abụkarị ndị nwe obodo na ndị ọchị ehi na-ebokọrịta onwe ha ebubo mwakpo a na arụ ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị mmadụ akwaala arịrị maka ogbugbu na nkwafu ọbara a, mana ọtụtụ amaghị etu ya bụ ọgbaghara siri bido. Tebulu a ga-akọwa mgbe ya bụ ọgbaghara bidoro, ndị o metụtara na ihe butere ya. Gịnị ka eji alụ ọgụ a? Ndị otu Amnesty International, bụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye, na-ekwu na ha mere nnyocha wee chọpụta na ọ bụ egbe Ak-47, egbe ọka, ogbunigwe na mma dị iche iche, ka e ji alụ ọgụ ma na-akwafu ọbara a. (Nyocha Egbe) Kedụ ihe gọọmentị na-ekwu maka ogbugbu ndị a? Otu Amnesty International kwukwara na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gwara onyeisi ụka 'CMS' na ọ bụ ndịagha mba Libya nakwa egbe ha si na mba ha webata na Naịjirịa, na-enye ndị a ike. Buhari kwuru sị "" Ọ bụghị taa ka nsogbu a bidoro, ọ bụ ndịagha onye chịburu Libya bụ Muammar Gadaffi zụrụ, ndị nke gbara ọsọ mgbe Gadaffi nwụrụ. Anyị zutere ọtụtu ndị a mgbe anyị na-aluso Boko Haram ọgụ. Ndị Fulani anyị ma na-eji mma na osisi. Nsogbu a abụghị maka ofufe, kama ọ bu maka akụnụba na mmekọrịta"". Kama ndị otu a na-ekwu na naanị ihe kwadoro ihe Buhari kwuru bụ naanị ngwaagha ndị omekome a ji alụ ọgụ. NLTP na atụmatụ ndị ọzọ N'ọnwa Febụwarị afọ 2018 ka gọọmentị etiti hiwere nzụko nke osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo bụ onyeisi ha, ka ha gaa obodo ndị a ọgbaghara metụtara ka ha mata etu gọọmentị ga-esi kwụsị mkpamkpa ndị a. Atụmatụ gọọmentị kacha tinye uchu bụ nke ""National Livestock Transformation Plan"" (NLTP). Atụmatụ a bụ nke e bu n'obi na ọ ga-akwụsi ọgụ n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo nke a ga-eji afọ iri were hiwe. Atụmatụ a ga-agụnye Achụmnta ego, ikpe udo, ihiwe iwu obodo, enyemaka, agụmakwụkwọ na atụmatụ ndị ọzọ. NLTP ga-ewe afọ iri ma riekwa ijeri naira otu narị na iri asaa na itoolu. (Otu Amnesty International)" afirika-47844014,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47844014,Christian Chukwu: Femi Otedola agbatala ọsọ enyemaka,Egwu ọma ejula ọnụ ndị be Christian Chukwu na-arịa ọrịa dịka akajiakụ bụ Femi Otedola kwetere ikwụ ụgwọ ụlọọgwụ ya.,"Chukwu bụbụ onye nchịkọta otu Super Eagles Ụgwọ ahụ ruru puku dọla iri ise. Ụlọọrụ mgbasa ozi ""Cable"" depụtara na Otedola mere nke a iji kwado onye o chere fere ala nna ya n'ụzọ dịmma. Otu akpọrọ Nigeria Football Federation ekwela nkwa ịnyere Chukwu aka. Christian Chukwu so na ndị mbụ butere iko mba ụwa Afrika Chukwu onye dị afọ iri isii na asatọ chịrị otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa bụ Super Eagles mgbe ha mabutere iko mba Afịrịka mbụ n'afọ 1980. Cheta na gọọmenti Enugwu steeti gọrọ ụkwụ na aka na o nweghị mgbe ha gbahapụrụ Christian Chukwu bụ onye dara nnukwu ọrịa ugbua. Udedi Joseph bụ Kọmishọna egwuruegwu na-ekwu na gọmentị Enugwu akwụọla ụgwọ ihe niile na onye ọbụla na-arịọ ego n'isi ya bụ onye nrụrụaka. Ọkụ gbara n'ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị nOwere Ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị na Owere gbara ọkụ n'ehihie Monde. Ihe ọma dị ya bụ na emenyụọla ya bụ ọkụ ebe ebugharịrị nfeda ụgbọelụ. Ụlọikpe Ukwu akwọpụla aka n'isi Magnus Abe Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara ịgbagha onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti. Nke a mere dịka otu akụkụ APC na Rivas họpụtara Tonye Cole, ebe nke ọzọ họpụtara Abe dịka onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019. Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monde na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ. Tanzania ga-eso mechie 'water proof' Prime Minister mba Tanzanian bụ Mizengo K Pinda Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara megide onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti. Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monday na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ. N'egwuruegwu, Anyị na-echebiri asọmpi Chelsea na West Ham n'abalịa, Ire na izu ahụ mmadụ Emechiela ire na ịzụ anụ ahụ mmmadụ na mba ụfọdụ Otu kpọrọ onwe ha International Organisation for Migration ekwuola na ọnweghị mgbe ha ji kwuo na iri na izu ahụ mmadụ juru eju na mba Middle East. Onye kwuru nke bụ ọnye ọnụ na-eru n'okwu na otu ahụ bụ Ikechukwu Attah. Gee nkeji anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị agha Naijiria si na lekwara nwaanyị ha kuturu n'Aba Ndị agha Naijiria Akụkọ kwuru na ụgbọala Hilux nke ndị agha Naijiria kuturu nwaanyị na-agara onwe ya ka ọ chọrọ ịgbafe okporoụzọ ụbọchị Fraide. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọdachie ahụ akaghị ime ma ọ bụụ ụgbọala ahụ agbaghị n'okporo o kwesghị ịgba ma jirikwa oke ọsọ mee nke a. Mana isiụlọọrụ ndị agha Naijiria kwuru n'akụkọ na ha eletaghị nwaanyị ha merụrụ ahụ abụghị eziokwu. Na nkọwa ha, ha kwuru na ha bugara ya ụlọọgwụ ma kwụkwara ya ụgwọ ụlọọgwụ. Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ ndị biara na-eleta ya n'ụlọgwụ. Ndị ntọ atọrọla onyeisi ndị ọrụ imenyụ ọkụ na Legọs Rasaki Musibau nọ n'etiti Onyeisi ndị uweojii bụ Bala Elkana ekwuola na ndị ntọrị nwụchịkọrọ Rashidi Musibau na mmadụ isii ọzọ na mpaghara Ikorodu n'abalị Satọde akpọbeghi ezinụlọ ndị ha tọọro. Rashidi Musibau bụ otu n'ime ndị isi ndị ọrụ gbatagbata na Legọsi. Elkana kwuru na ndị ntọrị tọrọ ya na mmadụ isii ndị ọzọ ya na ha so n'ime obodo Ikosi-Ejirin, ọ sị na ndị ntọrị si ebe mmiri nọ wee gbochie ha n'ụzọ, tọrọ ha gbaba n'ime ụgbọ mmiri ha. Ụgbọelu bepụrụ isi onye agha Ihe nya mmiri mere mgbe mberede kwanyere otu onye agha si agha lọta na mma ụgbọelu nke bere isi ya tọgbọ. Eniela nwa amadị a so ebuso Boko Haram agha n'usoro ndị alakuba. Ndị ogbunigwe nwụrụ eruola mmadu ise Ndị ọrụ gbata gbata na Maịduguri na-akọwa na ndị nara mụọ site na ogbunigwe ndị omekome abụọ gbara ụnyaahu eruola mmadụ ise ka ndị ihe a metụtara n'eru mmadụ iri anọ na ise. Ihe a mere mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe ha bu n'ahụ na obodo Muna Dalti. N'ofesi Kirstjen Nielsen bidoro ọrụ n'afọ 2017 Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa obodo na mba Amerịka bụ Kirstjen Nielsen esorola n'ime ndị Onyeisiala Donald Trump tinyere n'ọrụ tinyere akwukwọ arụkwaghịm. N'egwuregwu Nwaafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo so na ndị denyere aha ya n'akwụkwọ mgbe Shanghai Shenhua ji ọkpụ goolu ise asatara otu sị Beijing Renhe ntọọị n'asọmpị Chinese Super League asụru ụbọchịụka Lee ihe nkiri anyị tata Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala Akụkọ ga-amasị gị" mba-uba-43566576,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43566576,China na Nọt Koriya ekwupụtala maka njem Kim Jong-un,E kwupụtala na ọ bụ ezie na Kim Jong-un bụ onyeisiala mba Nọt Koriya mere njem gaa mba China.,"Ndị ndu ahụ na nwunye ha gara nzụkọ ahụ Mba China na Nọt Koriya bụ ndị kwupụtara maka njem ahụ bụ nke mbụ Kim na-aga mba ofesi kamgbe afọ 2011 ọ bidoro ọchịchị. Kim na onyeisiala mba China Xi Jingpin nwere ezi mkparịtaụka na Beinjing bụ isi obodo mba China. China bụ mba ha na Nọt Koriya kachasị enwe mmekọrịa azụmahịa ebe ndị mmadụ tụrụ anya na ha ga-achọ ịma ihe ndị CHina chere tupu ha na mba Sawụtụ Koriya na US enwe izu. Kim kwesiri izute onyeisiala mba Sawụtụ Koriya Moon Jae-in n'ọnwa Apreel nakwa onyeisiala mba US Donald Trump na n'ọnwa Mee. Njem ahụ o mere gaa Beinjing bụ ụzọ pụrụiche iji kwado maka izu na mkparịaụka ahụ. Na njem ahụ, Kim kwere ndị mba China nkwa na ya na-etinye uchu iwezuga ngwọ agha nukiliya ya mana ya nwere ọnọdụ. N'okwu ya; ""Okwu iwezuga ngwoagha nukiliya nwere ike ibụ ihe gara aga ma ọ bụrụ na mba Swaụtụ Koriya na mba US ga-emeso ha ezi omume, mepe ohere ikpe udo nakwa inye aka weta udo na ịganihu."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52654236,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52654236,'Ọ bụghị Ojukwu dubara ndị Igbo agha Biafra' - Bishop Obi Onubogu,BBCIgbo na onyeisi ụlọụka Rock Family bụ Obi Onubogu nwere mkparịtaa ụka ka o bunye anyị uche ihe ọ chere maka Biafra ya na ọrịa coronaviorus ma ihe ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ.,"Onubogu onye toro n'Ọnịcha kwuru na ọ bụ mgbe ọ gara akwụkwọ ka ọ hụtara ndị na-aga ekpere Kraịst. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ banyere ọrụ uweojii n'afọ 1964 ma rụọ ọrụ dịka onye na-achịkọta isiụlọ ndị Biafra n'Umụahịa. Lee ka o siri tinye ọnụ n'ihe gbasara ọrịa Coronavirus na okwu ndị ọzọ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ. Kedu etu ọrịa Covid-19 si metụta okpukpere nke Kraịst? Obi Onubogu kwuru na ọrịa a bụ atụmatụ ekwensu webatara i ji megịde ụka ma tinye ụjọ na obi mmapụ nye ụfọdụ ndị nke Kraịst. O kwukwara na ọrịa covid-19 bụtere agụụ ma mee kwa ka ndị mmadụ hapụ ịzịsa ozi ọma. Echiche ya maka agha Biafra na Odimegwu Ojukwu Obi Onubogu kwuru na ọbụghị Dim Odimegwu Ojukwu dubara ndị Igbo n'agha Biafra kama na ọ bụ mkpebi ndị Igbo. Mgbe ọ chọrọ ịkọwa ihe o ji echeta Ojukwu, O kwuru otu ihe mere n'obodo azụmịrị ebe ndị agha Biafra na nke Naijirịa jụrụ ilụ agha si kama ka ha bụrụ enyi. Kama otu mgbe ha gara ị nwe aṅụrị n'Aba dịka ha sị eme, mgbe ha mechara ndị agha Biafra nwụchịrị ha were zịgara Ojukwu ozi na ha ejidela ndị agha Naijiria karịrị otu nari. Ojukwu pụtara were baara ndị agha Biafra mba ma nye iwu ka ha kpọrọ ndị agha Naijirịa ha jidere me leta ha anya tupu agha ebie. Ihe Obi Onubogu chere maka imechi ebe ofufe? Onubogu kwuru sị ""orụọla mgbe gọọmentị ga-elebara mmachị amachiri ụlọụka"". Ọ jụrụ "" kedu etu ị ga-esi mepee ụlọọgwụ, ọdọ ahia na-ebe ndị ọzọ were kpọọ ha ihe dị mkpa ma mechie ụlọụka nke kachasị mma maka mmepe obodo?"" Onubogu sị na-etinyere iwu a, ọ dị ka ọ na-emegide ndị nke Kraịst. Kama o kwuru na n'oge na-adịghị anya na gọọmentị ga-ewepụ ya bụ mmachi. Ihe o kwuru maka ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ma ndị ụka ha a na-nyere ndị mmadụ aka oge mmachi a O jị ụlọụka Rock family church maa atụ were sị na ha chọpụtara ndị ihe na-esiri ike were nyere ha aka. Onubogu kọwara na ihe mere bụ na ndị ụka anaghị eti mkpu ma ha mee ihe, n'ihi na ha nwere ifunanya nke Chineke. Lee ya n'uju ya ebe a" afirika-48122781,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48122781,Workers Day: Ka o si gaa na mpaghara ọwụwa anyanwụ,Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti ekwetala ịkwụ ndị ọrụ steeti ya ụgwọ opekatampe ọhụrụ.,"O kwuru nke a n'emume emere ụbọchị a na-echeta ndị ọrụ na mba ụwa niile na steeti ahụ. Umahi kwara arịrị maka etu esi mee ndị ọrụ n'akụkụ ụwa niile ma kwuo na ọ ga-agba mbọ hụ na ọ hụrụ maka ọdimma ndị ọrụ steeti ahụ. New minimum wage: 'Ego ahụ enweghị ihe ọ ga-ezu'- Ndị ọrụ Ndị ọrụ nọ na steeti mpaghara ọwụwa anyanwụ dị iche iche chọrọ ka ebido mezue nkwa ụgwọ ọnwa ọhụrụ gọọmenti kwere ha. Ha kwukwara etu ụgwọ a ga-esi metụta ndụ ha. Gere ya. Ugwuanyị wepụtara N100milion maka ịkwụ ndị ọrụ n'ala ezumike kwa ọnwa Ndị ọrụ mpaghara ọwụwa anyanwu anaghịkwa achị dịka ha pụtara n'igwe isonye n'emume ncheta ndị ọrụ na mba ụwa niile. Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugu steeti kelere ndị ọrụ steeti ma kwe nkwa na ya ga na-akwụ ha ụgwọ ọnwa n'oge. O kwere nkwa na n'ọchịchị ya ga-ahazi ihe gbasara ikwụ ụgwọ opekatampe nkeọma. Onyeisi ndị ọrụ na steeti Enugu bụ Chukwuma Igbokwe chetara gọvanọ Ugwuanyi na ndị ọrụ na-ahụ maka mmiri na steeti ahụ enwetebeghị ụgwọ ezumike nka ha. Ndị ọrụ ọwụwa anyanwụ kwụ n'ahịrị na-azọ ka dịmkpa na-enweghị ụjọ ọbụla. Ụfọdụ n'ime ha yi uwe di icheiche iji me ka ebe niile chakee. N'owerri, Ndị ọrụ pụtara n'uju n'Owerri Imo steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48971107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48971107,Nsibidi Writing: Akara ochie e jiri mara ndị Igbo,Ọtụtụ mmadụ amaghị na ndị Igbo nwere ederede ha ji agbasa ozi ma na-edekorịta ihe mere tupu ndị ọcha amalite inwe mkpụrụ edemede nke ha.,"Ndị Igbo kpọrọ nke ha Nsibidi, Nchibidi ma ọ bụ Nsibiri. Mana aha akacha akpọ ya bụ Nsibidi. Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, bụ onye nkuzi na mahadum Legos kọwara na dịka ụfodụ mmadụ siri na-eche, Nsibidi abụghị mkpụrụ edemede, kama ọ bụ ihe esere ese ndị mgbe ochie jiri agbasa ozi. Kedu etu Nsibidi siri bido? Ọnweghị onye ma etu Nsibidi siri bido n'ihi na ọ bụ ndị otu nzuzo dika Ekpe na Ọkọnkọ nwe ya, mana otu ihe dooro anya bụ na ọ tọrọ akara edeme ndị Ijipt, nke Bekee kpọrọ ""Heliographics"", dịka Okammụta Nnnabuihe kwuru. N'akụko ifo ụfọdụ, ọ bụ Utobo ka e si kuziri ndị Igbo Nsibidi. Ihe eji Nsibidi eme Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ eji Nsibidi mara Ọ bụ n'ala Igbo na ụfodụ mpahara steeti Cross River, Rivers na Akwa Ibom ka ndị ji Nsibidi mee ederede bi mgbe ochie. Ebe ọbụla enwere ọkọnkọ, ekpe ma ọ bụ mmanwu n'ala Igbo na ufodị mba gbara Igbo gburugburu, ị ga enweta Nsibidi. Ndị nọ n'otu Mmanwụ, Ekpe na Okọnkọ bụ ndị ma maka Nsibidi Gịnị mere Nsibidi jiri laa? Akara Nsibidi karịrị otu puku mana n'ihi na a na-ede ya na ukwu osisi, ahụ aja, maọbụ a kanye ya n'ahu mmadu, ọtụtụ akara Nsibidi efuola. Mana ụfọdị ihe so na ihe mere Nsibidi jiri fuo gunyere: Na agbanyeghi na ọtụtụ ya efuola, akwụkwọ Ọkammuta Elizabeth Isithei dere nke ọ kporọ ""History of the Igbo People"" gosiri ufodụ Nsibidi ndị Igbo mgbe ochie ji ezisa ozi. Lee Ufọdụ n'ime ha na mpụtara ha: Alụm Di na Nwunye Alukwaghim Nwoke luru umunwaanyị abụọ na ụmụ ha Nwaanyị chọrọ igba di ya alukwaghịm Nwunyedi abụọ na-ese okwu mgbe niile. Ihe nkiri ga-amasị gị Igbuichi ndi umudioka" afirika-43291851,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43291851,Charly Boy: Iwe anyị bụ na a na-emechi ndị ntaakụkọ ọnụ,"Ọ bụrụ na-enweghi ihe mgbochi ọbụla, ndị otu #Mumudondo nke Charles Oputa (Charly Boy) akwadosila njeghari iwe ha ga-eme n'Abuja ụbọchị Wednezde maka onyeisi ụlọọrụ mgbasa Daily Independent ndị ọrụ DSS jidere.","Charly Boy ji otu ya #MumuDondo ajụ ndị ọchịchị ase etu ha si achị E jidere Tony Ezimakor n'Abuja maka akụkọ ndị ụlọọrụ Daily Independent mere gbasara ego e kwuru na ndị gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ndị Boko Haram. Ndị DSS ji Tony kamgbe ụbọchị 28 Feburuwarị afọ 2018 ka o kwuo ebe ha si weta akụkọ ahụ ha buru. N'aka nke ọzọ, Charly Boy kwuru na ihe ndị DSS mere jọgburu udele sigbuo nkakwụ maka na Naịjirịa nwere iwu onye kwuo uche ya. Charlie Boy ji otu ya #MumuDondo ajụ ndị ọchịchị ase gbasara etu ha si achị Dịka o si gwa BBC Igbo - ""Ndị ntaakụkọ na-agwa anyị etu Naịjirịa si aga, ndị gọọmenti mechicha ha ọnụ, ole ndị ga na-akọwara anyị na-agwa anyị eziokwu?"" O kwuru na dịka nwa afọ Naịjirịa, na ha nwere ike ime ngagharị kwuo etu ọchịchị si ewuta ha mana ha degara ndị ụweojii akwụkwọ ka ha mara maka ngagharị ahụ. Ihe ndị otu #OurMumuDonDo na-ekwu Otu ahụ dere n'akara ha na twita na ha chọrọ ka ndị DSS hapụ onye ọrụ Daily Independent ha ji. Otu ndị dị ọzọ dịka Concerned Nigerians, Campaign for Democracy sonyere na ndị ga-eme ngagharị iwe ahụ. N'aka nke ọzọ, ndị ụlọọrụ Daily Independent kpọkukwara gọọmenti etiti ka ha hapụ onye ọrụ ha ha jidere. Otu ajụjụ dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ ka gọọmenti Naịjirịa a na-egbochizi iwu onye kwuo uche ya?" media-44096240,https://www.bbc.com/igbo/media-44096240,Akụkọ kachasị n'abalị : Anyị anaghị anapụta ndị akpọchịrị ego - Onyeisi ụlọmkpọrọ Anambra,Akụkọ kachasị n'abalị a Anyị anaghị anapụta ndị akpọchịrị ego - Onyeisi ụlọmkpọrọ Anambra,"Onyeisi ụlọmkpọrọ nke Anambra steeti bụ Emmanuel Nwakaeze na-agọ ebubo na ndị ụlọọrụ ya na-anapụta ndị akpọchịrị n'ụlọmkpọrọ ego tupu e kuru ha gaa ụlọikpe. Nwakaeze kwukwara na govanọ steetị ha bụ Willie Obiano kwesiri ị leeba anya na okwu makana ọnụ ọgụ ndị noọ n'ụlọ mkpọrọ karịrị akarị. Eboola gọvanọ Rochas Okorocha ebubo gbasara ọkụ gbara ụlọọrụ APC n'Imo steeti Theodore Ekechi bụbu kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo steeti ekwuola na ọ bụ Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị otu ya mụnyere ụlọọrụ APC ọkụ ụnyaahụ. Ekechi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ndị Imo jụrụ Rochas Okorocha maka arụ ọ na-eme na steeti ahụ. O kwuru na nsogbu a niile bidoro mgbe ya na ndị otu ya jụrụ ka gọvanọ webata ọgọ ya nwoke n'ọchịchị Imo steeti. Ndị agha Kenya na-achọ ndị Briten abụọ atọrọ Ndị agha ala Kenya ekwuola na ha abanyego n'ime ọchịchọ ndị na-eme njem abụọ sị mba Britain a tọrọ n'ebe egwuregwu n'ala Congo. Onyeisi ebe egwuregwu a kwuru na ndị ji egbe wakporo ha, ma gbuo onye na-anya ụgbọ ala ha. R Kelly na-agọ ebubo nwakpo ụmụnwanyị Onye egwu aha ya bụ R Kelly na-eme mme mme egwu na North Carolina mana ọtụtụ mmadụ na-eme nghagharị iwe n'ebe ahụ makana ha na-ebo ya ebubo na-owakporo ọtụtụ ụmụnwanyị. Mana R Kelly ka na-agọ ebubo a. Gee akụkọ anyị n'abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa" afirika-47097982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47097982,BBNaija Stampede: Ndị mmadụ e meruela ahụ n'ihe mmemme nhọpụta Big Brother Naija,"Akụkọ na-erute anyị ntị na-ekwu na ndị mmadụ a mabeghị ole ha dị merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ tụbọrọ dịka ndị ntorobia pụtara n'igwe ebe a na-eme nhọpụta maka emume Big Brother Naija agba nke 2019.","Ndị bịara mmemme nhọpụta BB Naija N'ụbọchị Fraide, e mere nhọpụta ahụ n'ebe dị iche iche na Naijiria dịka Abuja, Enugwu, Portharcourt na ebe ndị ọzọ na steeti dị iche iche na Naijira. Mgbe BBC Igbo na-agba ya ajụjụ ọnụ site n'ekwentị, Carol Ogwuma, ọnụ na-ekwuru Multichoice bụ ndị kpokobara BBNaija bụ kwuru n'ezie n'ihe ahụ mere. Ogwuma kọwara na ''anyị ma na enwere ndị mmadụ bụ ndị meruru ahụ maọbụ tụbọọ'' n'ihe mmemme ahụ. Ka osila dị, o kwukwara na-enwere otu ndị gbatagbata na-enye ọgwụ bụ ndị nyeere aka labenye anya na nsogbu ahụ. Ọtụtụ ndị ntorobia agaala n'ihu ma kwupụta uche ha n'ọnọdụ a n'igwe mgbasa ozi soshal midia. @Bhadoosky kwuru, ''Maka Chukwu, ahụtụbeghị m ụdịrị ndị ntorobịa si otu a pụta kamgbe m bidoro tụwa vootu. Ọ bụrụ na ha ga-apụta otu a n'ụbọchị Febụwarị 16, 2019. Nke a bụ nhọpụta #BBNaija na Legọs''. @DrOlufunmilayo kwuru, ''Ọbụrụ na ndị ntorobịa a gaa maka ntụliaka onyeisiala nke afọ 2019 site n'ike na obi ha ji aga #BBNaija, n'ezie anyị gaara achịkọta onwe anyị ọnụ iji wepụta onye ga-enweta mmeri ọkwa onyeisiala''. Na nke ya AdaJoe kwuru, ''Nhọpụta ihe mmemme big brother na-egosi etu gọọment siri mejọọ ndị ntorobịa. Puku kwụrụ puku ụmụntorobịa nọọrọ na-eme nhọpụta ụbọchị Fraide mgbe ha kwesiri ịnọ n'ụlọakwụkwọ maọbụ n'ụlọọrụ. Abụbọ ọrụ ASUU kana aga n'ihu. Onwekweghị ọrụ dị n'otu aka ahụ''. Onye ga-enweta mmeri na-afọ ga-enweta ego dịka nde naịra iri atọ na isi (N36million). Cheta na Miracle Igbokwe si steeti Imo ritara ego dị nde naịra iri anọ na ise (N46milliion) n'ihe mmemme Big Brother Naija nke afọ 2018. Akụkọ ga-amasị:" afirika-43616132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43616132,Mmadụ 15 nwụrụ na Maiduguri - Ndịagha Naịjirịa,Ndịagha Naịjiria ekwuola na ihe ruru mmadụ 15 nwụrụ ebe mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ọgụ dara n'etiti ha na ndị otu Boko Haram n'abali ụnyaahụ.,"Ụmụaka gbara ọsọndụ maka nsogbu ndị Boko Haram Onye na-ekwuchitere ndịagha Naịjiria bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndịagha wakporo ọtụtụ ndị Boko Haram ebe ha na-achọ ụzọ ha si abata Maiduguri were ọnọdụ. Nwachukwu gara n'ihu sị ""Ndịagha anyị chọtara egbe abụọ na ngwa ọgụ ndị ọzọ n'aka ndị na-eyi ndụ egwu."" Ha gbagburu ndị Boko Haram ruru isii ma kwụsịkwa ndị asaa ọzọ na-akwadọ ị gba ogbunigwe ebe ahụ. Nwachukwu kwuru na-ebe ndị otu ahụ hụrụ na ha agaghị enwe ohere me uche ha, ha malitere igbu ndị bi n'obodo Biile Shuwa na Alkarantị dị na mpaghara Maiduguri. Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Cheta na akụkọ pụtara n'ụtutu na ụda egbe n'ogbunigwe si ihu agha dị nso na Maiduguri na-agba ndị mmadu ụra. Ndị ma maka ihe na-eme n'ọrụ nchekwa na mpaghara Maiduguri sị na ọ bụ ndịagha Naịjiria na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram na-akwa mgbọ oge ahụ. Cheta na kemgbe afọ itoolu, ndị Boko Haram na ndịagha Naijirịa na-akwata mgbọ na ugwu ọwụwa anyanwụ Naịjiria. N'afọ gara aga, onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ha emeriela Boko Haram, mana ihe na-eme egosighị na okwu ha bu eziokwu. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43369301,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43369301,Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo?,Ile ọmụgwọ n'omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya).,"Ọmụgwọ bụ ọmenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ. Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya. Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ. Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya. Ihe nne na-eme n'ọmụgwọ Uru ọmụgwọ bara Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa. Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ. 'Ụmụnwaanyị anyị kajara akaja' - Charly Boy Nri ekwesịrị iri n'ọmụgwọ Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche. A na-ekwu na ụda na-egbochi afọ ime na ọrịa ndị ọzọ dịka agbaikpere Nri nwaanyị ekwesịghị iri n'ọmụgwọ Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ngwụcha ọmụgwọ Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu. Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie. A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi." afirika-50445939,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445939,Nnamdi Azikiwe: Kedụ ihe ị ji mara 'Zik of Africa'?,Nnamdi Azikiwe so n'ime otu n'ime iri a ga-akpọpụta aha ha ma a kọwa akụkọ etu Naịjirịa si nweta nnwereonwe ha n'aka ndị Briten.,"Azikiwe nke a na-etu 'Zik of Africa' gaara adị afọ 116 n'afọ 2020 a ma ọ bụrụ na ọ ka dị ndụ ugbua. Uche Azikiwe: 'Etu Nnamdi Azikiwe si lụọ m' Azikiwe tupu ọ nwụọ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Mee afọ 1996, bụ otu nwoke kpu ọtụtụ okpu n'isi ya n'ihe gbasara dimkpa tozuru etozu. A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, o so na ndị ndị ọcha nyefere ọchịchị Naịjirịa n'afọ 1960, a bịa n'agụmakwụkwọ, ọ bụ dike; a bịakwanụ n'ogologo na mma nwoke, ọ kwụ chịm. N'ihi ụdịrị agba o nwere na Naịjirịa ka e ji nwee ihe ndị e tinyechara iji wee na-echeta ya. Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya Ihe ndị a gụnyere ihu ya e biri n'elu ego naịra narị ise (N500), ọdọụgbọelu e si efepụ na Naịjiria dị n'Abuja, mahadum dị n'Ọka, Anambara steeti, ọgbọegwuregwu dị n'Enugwu steeti, ụlọọbaakwụkwọ dị na mahadum Nsụka, dgz. Ude ya degidere wee gafee Naịjirịa, garuo mba Tanzania ebe a gụrụ otu ụzọ dị n'obodo Dar es Salaam aha ya, nakwa otu ụlọ dị na mahadum Lincoln dị na mba Amerịka bụ nke aha ya na Kwame Nkrumah dị na ya. Ezenwaanyị Elizabeth bubara ya n'ọkwa Privy Council nke mba Briten Ihe ị kwesịrị ịma maka Zik Ọ bụ Azikiwe bụ onyeisi pati ndọrọndọrọ bụ National Council of Nigeria and Cameroon (NCNC) Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12" media-48486897,https://www.bbc.com/igbo/media-48486897,Rochas Okorocha: Ndị omeiwu Imo achụọla ndị niile Okorocha were n'ọrụ ka ọ na-apụ,Akụkọ dị mkpa Ach ụọ la ndị Okorocha were ọrụ gbanụ gbanụ,"Ụlọ omeiwu steeti Imo akagbuola ọkwa ọchịchị gbanu-gbanu niile ọchịchị Rochas Okorocha mere ka ọnwa Maachị afọ a gachara. Ụlọ omeiwu a n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Monde bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Juun gwakwara ọchịchị ọhụrụ enwere na steeti Imo ka ọkpọtụrụ otu ọrụ na-ahụ maka mpụ bụ EFCC nakwa ụlọ ọrụ ndị ọzọ iji natacha ego niile ha sị na- ezukọrọ na steeti ahụ. Ụlọ omeiwu ahụ gakwara n'ihu ma kagbuo atụmatụ nhọpụta nke otu ""board"" dị iche iche nke ọchịchị Okorocha mere. Ka osila dị, ụlọ omeiwu a mekwara ka amata na ha akwụsịtula ndị isi oche otu council 27, ndị osote ha nakwa ndị Councilor enwere na steeti Imo ọrụ n'ihi erubeghị isi nye iwu ụlọ omeiwu a. Ha gwaziri ndị DAGs nọ n'okpuru ọchịchị ime obodo ka ha weghara ọchịchị council ka ọ dị ugbu a. Ndị ọchịchị ime obodo na-eme ngaghari iwe n'Owere Ndị agha Sudan awakpola ndị na-eme ngagharị iwe Gunfire can be heard as protesters flee Ndị agha na mba Sudan gbara mmadụ iri na atọ tọgbọrọ ka ha gara itisa ndị na-eme ngagharị iwe maka iwelata ọchịchị n'aka ndị mkpọrọ. Ndi agha were ọchịchị na mba ahụ kemgbe achụrụ Omar Al-Bashir n'ọkwa Jay-Z sozi na ndị bụ ide ego nwere ijeri dọla Jay-Z bụ onye oti egwu mbu nwere ijeri dọla n'aka, dịka ọlụ ntaakụkọ Forbes siri kwuo. Dịka Forbes dere, ọbụghị sọ nanị egwu ka Jay-Z jiri kpata ego ya. Jay-Z na-ere akwa site na akara ya ọ kpọrọ ""Rocawear, nwe ebe a na-eti egwu na internet akpọrọ Tidal, ma nwekwa Roc Nation - ebe a na-ahazi egwu na nwaga egwuregwu dị iche iche. Aka akpara nwaanyị gburu nwa ya Aka ndị uweojii akparala nwaanyị asị gburu nwa ya nwaanyị dị obere n'obodo Amankanu Amuri dị n'Enugwu Steeti. Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu zitere BBC Igbo kwuru na nwaanyị a n'ogogo afọ iri atọ ebe nwa ya dị otu afọ na ọnwa ise. Asị na nke a mere n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee. Amaraizu sị nyocha ka na-aga n'ihe ịmata ihe mere nwaanyị a ji gbuo nwa ya bụ nke ọ na-enyere ndị uweojii aka na n'ime nyocha. Kọmishịọna ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Sulaiman Balarabe enyela iwu ka ndị uweojii ngalaba nyocha sie imi n'ala chọpụta etu nke a si mee. Dịka ọ dị ugbua e dosala ozu nwata nwaanyị a n'ụlọ ozu Agbani dị n'Enugwu Steeti. Onyeisiala Buhari ahapụla Saudi Arabia O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Buhari ahapụla mba Saudi Arabia bụ ebe ọ gara ọgbakọ iri na anọ nke ndị otu a kpọrọ Organisation of Islamic Cooperation mere. N'ọgbakọ ahụ Buhari kelere ndị otu a maka mbọ ha na-agba iji hụ e chekwara ọdọ mmiri Chad ka ọ ghara imebi. Pope Francis arịọla mgbaghara Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Francis arịọla ndị obodo Roma dị na mba Romania mgbaghara maka ịkpaoke na mmegbu emere ha n'ime ọtụtụ afọ. Pope Francis bụ onye rịọrọ arịrịọ a n'aha ụka Katọlik niile mgbe o mere njem nleta na mba ahụ. Onweghi nwaanyị m bara n'ike - Neymar Nwafọ Brazil na-agba bọọlụ bụ Neymar agọrọla ụkwụ na aka ya n'ebubo na odinara otu nwaanyị n'ike n'obodo Paris Ndị uweojii wepụtara sị na otu nwaanyị na-arụ Neymar na ọ bara ya n'ike n'ime ụlọ ndịna France bụ ebe ọ na-agbara PSG bọọlụ. Nwoke liri nwa ya na Ndụ Loverth Odah - Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti Ka anyị bido n'Ebonyi steeti ebe otu nwoke akpọrọ Anthony Sunday ji aka ya lie nwa ya nwaanyị dị ọnwa ise na ndụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah gwara ndị nta akụkọ nke a ebe ọ nọ kwuo na ya bụ nwoke sị na ọ bụ ọnwụnwụ tinyere ya n'ọnọdụ ahụ. Aisha Buharị akụwa akị oyibo ndugbe Ụnụ anatakwara ego enyemaka gọọmenti ruru naira puku iri ? Onye na-ajụ? Aisha Buhari, mgbe ọ gara njem nleta na ogbe ndị gbara ọsọ ndụ na Kastina steeti ụbọchị Satụde. Ndị ahụ zara ya oolo na ya bụ ajụjụ. Trump ekwuo ọzọ N'ofesi, mba Amerika a nawala mmadụ ọkpa agwọ. Gịnịkwa ọzọ? Onyeisiala Trump si onye ọbụla ga-abịa mba ahụ ga-ebiputa nkata niile dị na sochal midịa ya ruo afọ ise ma were ya bịa maka ajụjụ ọnụ visa ha. Andy Ruiz kụpụrụ Anthony Joshua mkpụru ọkwụrụ n'anya N'egwuruegwu, ọ dịkwa ka aka ji Liverpool kemgbe afọ iri na anọ ahapụla ha. Liverpool ji okpụ goolu abụọ zuo Tottenham ike n'ahụ maburu iko Championship, ebe Andy Ruiz kụpụrụ Anthony Joshua mkpụrụ ọkwụrụ n'anya wee turu ụgọ n'egwuruegwu ọkpọ mbaụwa. Andy meriri Joshua na agba nke asaa ka o tituchara ya n'ala ugboro anọ. Nke a mere ka Andy bụrụzịa ọkaibe na ọkpọ n'ogogo nke ""heavyweight"". Ndị mmadụ na-eche na ume Andy ezughị imeri Joshua, mana ihe meziri gbagwojuru onye ọbụla anya. Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45795037,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45795037,"Donald Duke: Ibi ego na China, ofesi ga-akpụ Naịjirịa isi eru eru",Donald Duke bụ onye bu ọkọrọtọ ndị otu SDP na ntuliaka 2019 adọọla aka na ntị maka oke ụgwọ Naịjirịa na-ekonye onwe ya n'isi site mba China.,"Donald Duke chịburu Krọs Riva steeti n'aha otu SDP Duke onye kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịta ụbụbọ n'isi ụlọọrụ pati ha n'Abuja Ọ sịrị na oke ọmụrụnwa nke ruru pasent 30 Naijiria na-akwụ n'isi ụgwọ e ji mba China na mba ndị ọzọ emela ka achụmntaegọ siwanye ike na Naịjirịa. N'otu aka ahụ, ọkammụta na ihe gbasara akụnaụba na mahadum, 'Lagos Business School,' bụ Bongo Adi kwuru na China ji ego mbibi eke mba dị n'Afrịka agbụ. 'Ndị China na eji ego mbibi ego eke mba dị iche iche' Bongo Adi: Mbibi ego n'aka China ga-eke Naijiria agbụ Ọ tụrụ arịrị na Naijirịa adabawakwala n'ọnọdụ iji ụgwọ nwafọ Igbo bụ Ngozi Okonjo Iweala nyere aka hụ na a gbapụtara Naijiria. Adi kwuru na gọọmenti na-ebi ego aghara aghara n'aka China na obodo ndị ọzọ adịghị mma. O ji mba Zambia ebe ndị China weghara ọdọụgbọelu na nakwa ụlọọrụ na-emepụta ọkụ latrik nakwa and mba Congo ebe ha na-adọrọ Naijiria aka na ntị. Adi gbara ama na mba ruru 18 nọ na nnukwu agbụ na obi mmapụ n'ihi nsogbu oke ụgwọ ha jị China nke ọ kpọrọ 'Chinko imperialism' nke ọ kọweara bụ ijiigbanye bibi na-eke mba agbụ. Ọ mụrụnwa ego Naijiria birila China bụ pasent 30 'E ji pasent 70 eretara na mmanụ agbịdị akwụ ụgwọ anyị ji, ihe fọziri e ji arụ ọrụ bụ pasent 30."" ""China ji aghụghọ abịa n'Afrika na-aghọgbu ndị ọchịchị nchịgbu."" ´Ụmụ ndị anamụbeghị amụ ejidela ndị China ụgwọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44032244,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44032244,Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo,Mba niile nakwa agbụrụ niile nwere ihe ha na-asọ nke ha na-ewe na ime ya ga-ebutere ha ọdachi.,"Ime ụfọdụ ihe ndị ahụ mgbe gboo nwere ike ibute nsọ ala na ịsacha maọbụ Ịkwụ ala nke bekee kpọrọ 'cleansing'. Ụfọdụ n'ime 'nsọ' ndị a bụ ihe ndị a mụrụ n'ọgbara ọhụrụ nwere ike ịhụta dịka ihe na-atọ ọchị, maka etu o si dịka ihe na-araghị ahụ. Lee ihe isii (6) ndị Igbo na-ewe ka nkwenkwe ụgha nke bekee kpọrọ 'superstitious belief'. 1) Ịṅefe nwaanyị dị ime ụkwụ: Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ka mmadụ tiri mkpụ ""ngwa gafegharịa ụkwụ ya ọsịsọ"". Nke a na-abịa ma ị gafee ụkwụ mmadụ ọkachasị nwaanyị dị ime. Ha na-ekwu na Ị ṅefee ụkwụ nwaanyị dị ime, na ị ga-aghọgburu ya nwa nọ ya n'afọ (ya bụ na nwa ya ga-eyi gị kama iyi nne na nna ya) maọbụ ọ ga-amụta akpụda. 2) Aka ịkọ ụkọ: Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọbaaka na-akọ gị ụkọ na ọ pụtara na ezigbote ego ga-abanye aka n'oge na-adịghị anya. 3) Iji aka ekpe: Ụfọdụ na-ekwu na iji aka ekpe enye mmadụ ihe adịghị mma. Ha sị na ọ bụ mkparị nye onye ị na-enye ihe ọkachasị ọ bụrụ onye tọrọ gị. 4) Igbu mkpọrọhịhị: Ndị Igbo kwenyere na onye na-egbu mkpọrọhịhị n'abalị na-akpọpụta agwọ nke nwere ike ịbata n'ụlọ. Ha na-ekwukwa na mkpọrọhịhị na-ebutekwa mmụọ na-aga n'abalị. 5) Azala ụlọ n'abalị: Oge mmadụ na-eto, ọtụtụ ndị kwenyere na ịza ụlọ n'abalị na-akpọlite ndị mmụọ. Ha kwenyekwara na ịza ụlọ n'abalị bụ izafu akụnaụba dị n'ezinaụlọ ahụ. N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị Igbo anaghị ekwe ka ọnụ azịza metụ ha n'ụkwụ. A na-ekwu na ọnụ azịza metụ gị n'ụkwụ na ọ ga-ewepụ ihe ị ji bụrụ nwoke. 6) Ịza oku: Ndị Igbo na-ekwu na ị nụ aha gị ma ị hụghị onye kpọrọ gị oku, na gị azakwala. Ha kwenyere na ịza oku a nwere ike ibute ọnwụ maka na 'ọ bụ chi gị na-akpọ gị'. 7) Ịgba aka ahịa: Ụfọdụ ndị kwenyere na ọ bụrụ na ị kwụọ ụgwọ ma ị gote ihe n'aka ha, na ị bupula njọ ahịa gaara ajọ ha ụbọchị ahụ. Ha kwenyere na ị ga-ebutere ha akanchawa. 8) Ịghọ njọ maọbụ ịdọ ashị: Ụfọdụ kwenyere na ọ bụrụ na otito too gị n'anya, na ọ pụtara na ị naghị enye mmadụ ihe. 9) Ịma uzere: Ụfọdụ ndị na-ekwu na ị maa uzere na ọ pụtara na mmadụ na-akpọ aha gị n'otu ebe. 10) Iji enyo aga ahịa: Ụfọdụ ndị na-ekwu na ị were enyo gaa ahịa, tinye ya n'etiti ụkwụ gị, na ị ga-ahụ ndị mmụọ nakwa ndị ụkwụ ha na-anaghị emetụ ala. Ị chọrọ ịhụ mmụọ? Ị ma ndị ọzọ? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44492984,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44492984,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị ndu ala Igbo ekwesighi ịrapụta ndị Ipob,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Mbazulike Amaechi ekwuola na ndị ndu agaghị ịgbaghapụ ndị Ipob Onye bụbụ mịnịsịta okwu gbasara njem ụgbọelu n'oge gara aga bụ Mbazulike Amaechi akatọọla ndị ndu n'ala Igbo na ha rapụtara ndị otu Ipob na ndị ọzọ na-achọ Biafra. Ameachi kwuru na Ọ bụrụgodi na ndị ndu n'ala igbo ekwenyeghi na Biafra, ha agaghị ịrapụta ndị na-achọ ya maka na ihe ha na-eme adịghị njọ. Naịjirịa EFCC na-enyocha Babachir Lawal E boro Babachir ebubo na o jiri nde narị naira abụọ ịsụọ ahịa Onye bụbu odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa bụ Babachir Lawal ekwuola na ya na-anabata nyocha ndị EFCC na-eme maka ebubo mpụ e boro ya. Cheta na nchọpụta na-ebo Lawal ebubo na o ji ego karịrị nde naịra narị abụọ wee sụọ ahịhịa ebe o nyekwara ụlọọrụ aha ya dị dịka onyeisi ọrụ ahụ. Akụkọ mba ofesi Onye Yuganda mepụtara ngwọọrụ na-enyocha ọrịa mba ma ejighi ọbara Otu onye na-emempụta ihe na mba Uganda bụ Brian Gitta atụrụla ugo dị elu maka ihe ọ mepụtara e ji enyopụta nje ọrịa ịba na-ejighi ọbara ọbụla. Gita turu ugo Royal Academy of Engineering n'Afịrịka maka ngwọọrụ ahụ na-egosi ọrịa ịba site na-ịcha ọkụ mmemme. N'egwuregwu, Asọmpi Iko Mbawụa ka na-aga n'ihu Asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu ebe Ijipit ga-ezute Urogwe ma Moroko ga-ezute Iran taa. Cheta na Rọshịa jiri ọkpụ goolu ise asaghị cha cha merie mba Sawusi Arebia we bido ya bụ asọmpi ụnyaahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: ""Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1""" afirika-45957633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45957633,Mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-enyere APC aka karịa PDP - Felix Okafor,Onye ọkacha n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Felix Okafor akọwala etu mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-eji emetụta ndị Igbo n'afọ 2019.,"Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ banyere uche ya na mpụtagharị Nnamdi Kanu, o kwuru na nke a agaghị enyere ndị Igbo aka. O kwuru na ọ gaghị enyere ndị Igbo aka i nweta ọkwa osote onyeisiala maọbụ onyeisiala n'ihi na Kanu na ndị otu ya ekwenyeghi na Naịjirịa. N'okwu ya ""Nnamdi Kanu ekweghi na Naịjirịa bụ obodo, ọ na-akpọ Naịjirịa obodo ụmụanụmanụ O kwuru na Kanu ekweghị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa ka ọfọduzie Igbo ịbụ osote onyeisiala. Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019 Okafor gara n'ihu kwuo na mpụta Nnamdi ga-eme ka ndị mmadụ tụọ Atiku egwu na ọ wepụtara onye Igbo ga-eme ka-akpọ ganị ganị imegide Naịjirịa. "" Mpụtagharị Nnamdi Kanu agaghị enyere PDP aka, kama ọ bụ APC ka ọ ga-enyere aka"", Okafor kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45812363,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812363,Zamfara primaries: Ọbụghi eziokwu na anyị enweghi ndi ga-azo ọchịchị - APC,Pati na-achị Naịjirịa bụ All Progressives Congress (APC) asaala mkpebi ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ nke akpọrọ Independent National Electoral Commision (Inec) na Bekee mere maka ntuliaka imeụlọ nke ha mere na Zamfara steeti.,"Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Inec kwuburu na APC enweghi ndị ga-anọchịte anya ha na ntuliaka nke 2019 makana ha emeghị ntuliaka imeụlọ tupu ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba bụ oge Inec sị na nabata aha ndị ga-azọ ọchichị ga-emechi. N'okwu APC, dị n'akwụkwọ mgbasaozi onyeisi oche ha bụ Adams Oshiomhole binyere aka, mkpebi Inec na ha emeghị ntuliaka imeụlọ n'usoro kwesiri abụghị eziokwu makana ọbụghị ihe mere. APC sị na ha mere ntuliaka imeụlọ n'ụbọchị isi na asaa nke ọnwa Ọktoba 2019. Ha kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ha mere nzukọ na ụlọ ụra akpọrọ City King Hotel dị na Gusau, isi obodo Zamfara steeti, ebe ha nọ mee nkwekọrịta maka ndị ga-azọrọ ha ọchịchị. APC kwukwara n'usoro Inec wepụtara iji hazie ntuliaka imeụlọ nyere ha ohere inye Inec aha ndi ga-azọ ọchịchị rue ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Ọktoba, ""bụ oge ekwesiri iji hazie nsogbu pụtara na ntuliaka imeụlọ niile"". ""APC nọ n'ụzọ ihazi nsogbu pụtara n'ime ntuliaka imeụlọ anyị, nke mere o jiri tụọ anyị n'anya na Inec ekweghị ka anyị wepụta aha ndị ga-zọrọ anyị ọchịchị tupu ha eme mkpebi a,"" akwụkwọ APC a kwuru. APC gakwara n'ihu rụtụ aka na ha echeghi na otu na-anọghi n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) emeghi ntuliaka imeụlọ na Kano, mana Inec edegaghara ha ụdịrị akwụkwọ a. Cheta na ọgụ na mgba banyere ntuliaka imeụlụ ndị APC mere na Zamfara. Lee ọgbaghara batara n'ebe APC na-eme ntuliaka imeụlọ na Enugwu. APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43634605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43634605,Ebe nwoke nọ gbuo nwanne ya maka ịdụ ụlọ na Sango Ota,Okwudili ji mma oge we beka sia nwanne ya nwoke a na-akpọ Azubike Okoro na nwunye ya bụ Jacinta ebe ha nọ na erị nrị.,"Ụlọ obibi ezinaụlọ Okoro, nwoke nwanne ya gburu BBC Igbo ghọtara na Okwudili mụrụ ọrụ n'aka Azubike ebe ọ na-azụ ahịa osikapa, agwa na ihe ndịọzọ ihe ruru afọ atọ na Azubike ekwesila idu ya n'odibo mana ọ dughị ya. Otu onye agbatobi ha nọ mgbe ihe a mere a kpọrọ Esther gwara BBC Igbo na ọ bụ okwu ego na-ese n'etiti ụmụ nwanne ahụ. Akwa mmiri dị n'azụ ụlọ ezinaụlọ Okoro ebe ejidere Okwudili Ọ sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ Okwudili gburu nwanne ya bụ mbụ ọ nara ya ego ọ na-atụ anya n'aka ya bụ Azubike. Gee ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a: Nwoke egbuola nwanne ya na nwunye nwanne ya maka ego E jidere Okwudili ebe ọ na-achọ ị si mmiri dị n'azụ ụlọ obibi ha agba ọsọ maka mkpọtu nwanne ya mere tupu ọ nwụọ. Ndị uiweoji nọ na-agba Sango Ota kwuru na eburu la Okwudili gaba isi ụlọọrụ ha dị na Abeokuta maka nyocha zuruoke. Ha sị kwa na ha na-agba mbo ị chọta otu nwoke a kpọrọ Kenneth so Okwudili were gbuo Azubike na nwunye ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47103470,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47103470,Alex Ekwueme: Ezinaụlọ na ndị Oko kwanyere ya ugwu taa,"Ụlọụka St. John the Divine nke ndị Anglican n'Oko, Anambara steeti juputara n'ọnụ dịka ndị mmadụ pụtara ịkwanyere Alex Ekwueme ugwu otu afọ ọ lara mmụọ.","Alex Ifeanyichukwu Ekwueme onye a na-etu ide Anambra bụ onye jibu ọkwa osote onyeisiala na Naijiria. Arch Bishop Emmanuel Olisa Chukwuma bụ onye nọ n'isi ụka ncheta ya bụ. Nnukwu mmadụ Bishop Chukwuma dụrụ ụmụ Alex Ekwueme na ndị nwunye ya ndụmọdụ ka ha hapụ esemokwu na ịkpa one n'etiti ha ma họrọ ụdo na ihụnanya dịka nna ha Alex bụ onye udo tupu ọ laa mmụọ. Onye ọzọ kwuru okwuchuwu na ya bụ ụka ncheta bụ Prof Israel Okoye bụ Bishop Ihiala dayọsis dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha ṅomie ụdị ndụ Ekwueme biri. Ọ kọwara Ekwueme dịka onye obi ume ala nke na anaghị akpa oke ma ọlị. Ka ụka gbasara ndị mmadụ gara n'ili ekwueme ebe a nọ were kpere ya ekpere maka ezumike mkpụrụobi ya. Nwanne Alex Ekwueme bụkwazị Igwe ndị Oko prof Laz Ekwueme kelere igwe na ụmụ gbakọrọ Ka ha si kwanyere nwanne ya ugwu. Di ọkpara Ekwueme bụ Pastor Goodheart Ekwueme kpere ekpere ka chukwu duo ndị mmadụ bịara ya bụ mmemme ncheta otu afọ n'udo. Ndị ezu na ụlọ Ekwueme gunyere. Ụmụ ya ndị nwoke bụ Kenechukwu Afamefuna Ekwueme na Akaolisa Ekwueme kwuru na ha mụtara ndidi, ihụnanya na ịgụsi akwụkwọ ike na-aka Nna ha. Obi nke Onitsha bụ igwe Nnaemeka Achebe bịara ya bụ mmemme ebe onye ji ọkwa SSG n'Anambra Steeti bụ Mazi Solo.......nọchitere anya Gọvanọ Anambra Steeti." afirika-48646224,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48646224,Chimaroke Nnamani vs Gil Nnaji: ụlọikpe mkpegharị ebiela nkwa n'ike,"Ụlọikpe ikpe mkpegharị dị n'Enugu ""akwashiela"" akwụkwọ Gilbert Nnaji gbara Chimaroke Nnamani bụ onye na-anọchite anya Enugu East na Ụlọomeiwu ugwu.","Akụkọ ndị dị mkpa ụtụtụ a: Nnaji gbara Nnamani akwụkwọ na arịọ ụlọikpe ka ọ napụ ya mmeri omeriri na ntuliaka 2019 maka na-osoghị usoro pati weputere were pụta. Nke a bụ nke ugboro abụọ ya Gilbert Nnaji dara ada n'ụlọikpe maka ikpe a. Nnaji gara ụlọikpe mkpegharị ka ụlọikpe nta gwachara ya na ihe ọrịọrọ ya enweghị isi. Ụlọikpe ahụ machara Nnaji ikpe n'ihe atọ ọrịọrọ ya nke gụnyere na Nnamani anọghị mgbe pati PDP meere ha nyocha tupu ha apụta ya bu ntuliaka. Mana pati ha bụ PDP gbara akaebe na Nnamani so usoro niile pati chọrọ. Ụlọikpe ndị agha amalitela ikpe na Port Harcourt Ụlọikpe ndị agha amalitela ikpe mmadụ iri na anọ ndi otu ha bụ ndị ha sị na ha tinyere aka na mpụ dị iche iche dịka ntọ, ọchụ na ihe ndị ọzọ. Maj.-Gen. Jamil Sarham nke ụsụụ ndị agha Division isii na Port Harcourt sị na ndị agha ahụ sị na ogige ha. Gọmentị Hong Kong akwụsịla iwu butere ngagharị iwe Na Honk Kong, ọha emeriela gọment bụ ndị siri ọnwụ na ha ga-eti iwu ịbuga ikpe ndị mmadụ China bụ ndị metere ihe ikpe na Hong Kong. Onye ọrụ gọmenti bụ Carrie Lam kwụru na gọmenti ga-akwụsịlata iti ya bụ iwu chebere onye ha echiche maka ọgbaghara so ya n'azụ. Netherlands 3 - 1 Cameroon N'egwuruegwu, mba Africa na-akwa arịrị ugbua n'iko mba mbauwa ụmụnwaanyị ebe Netherlands ji ọkpụ atọ asatara otu nyụọ Cameroon ịkpakwụ taa na France. Gee nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ka enyeonye igbo ""Majority Leader"" n'ụlọ omeiwu ukwu Enyinna Abaribe bu ""Minority leader"" Ndị kwuru nke a bụ otu akpọrọ Igbo Amaka. Ha na-arịọ Onyeisiala Muhammadu ka ọ onye aka hụ na onyeisi ulo omeiwu nke Bekee kpọrọ ""Majority Leader"" ruru Igbo aka. Ọnyeisi otu a bụ Michael Okoro kwuru nke a Ebonyi state si na odoro mmadụ niile anya na-ekewapuru ndị Igbo n'ihe gbasara ọchịchị na Naịjirịa n'agbanyehi mbọ ndị Igbo na-agba maka ọdịnma na ịdịnaotu nke Naijirịa Ọ sị: ""Anyi ghotara na ọ di n'aka Ọnyeisiala ịhọpụta onye odeakwụkwọ Naịjirịa nke mere ka anyị kweta na inye ọnye Igbo ọkwaa ga-egosi na Onyeisiala kwenyere na idiịnaotu nke ndị Naịjiria."" Micheal Okoro kwukwara ka ndị Igbo were obi umeala na ntụkwasị obi bịa Onyeisiala nso ma kwadokwa ọchịchị ya. Cheta na pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) mere Eyinnaya Abaribe ihe Bekee kpọrọ ""Minority Leader"" n'Ụlọomeiwu ukwu. Ụlọakụ Central Bank nke Naịjirịa ejikerele imachi akara ụlo akụ ụlọ ọrụ ndị ji ego ofesi ebubata ngwa ahia iwu Godwin Emefieli bụ onyeisi CBN Central Bank nke Naịjirịa ekwuola na ọ ga-agbachi akara ụlọ akụ ụlọ ọrụ ọbula aka ya dị na iji ego ofesi bubata ahịa iwu amachiri na Naịjirịa. Ụlọakụ Central Bank machiri iji ego ofesi go ma bubata ngwa 43 nke osikapa na ncha so n'ime ha. Central Bank sị: ""Mgbe ọbula anyị chọpụtara na ụlo oru ọbụla na-eji ego ofesi ebubata ahia iwu, anyị nwere ikike iwachi akara ọbaego ụlọaku ụlọ ọrụ ahụ."" N'ofesi, Ụgbọ mmiri a agbara ogbunigwe Mba Jamani awụọla mmiri oyi n'ebubo mba Amerịka na-ebo mba Iran n'aka ha dị ogbunigwe gbara ugbo mmiri n'ime oshimiri dị nso na mba ahụ. Jamani si na ihe onyonyo Amerịka weputara ezughi iji sị na ọ bụ Iran kpara mkpa mkpa a. ""Anyị ghọtara ihe onyonyo a gosiri kama ọ gaghị ezu iji kpebie ebubo a,"" Haeiko Maas Mịnịsta n'ahụ maka mmekọ Jamani na mba ndị ọzọ kwuru. N'Egwuregwu, Super Eagles nke Naijirịa Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ahọtala mba atọ ọ sị ga eme ọfụma na Iko Mba Africa. Rohr gwala Goal.com na mba ndị a bụ Senegal, Tunisia na Egypt Chetakwa na egwuregwu AFCON 2019 ga ebiri ọkụ n'ụbochị 21 nke ọnwa Jun. Maka Naịjirịa, Maazi Rohr si na ọ bụ agba nke Semi Final ka anya ya di . Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Ihe ndị mmadụ kwuru maka inye ọbara" afirika-46585324,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46585324,'Nne bịa goro m ahịa' ebutela okwu n'ime ahia Yaba dị na Lagos,Ị gatụla ahịa ndị mmadụ a na-adọkasị gị ahụ maọbụ na-ebikasị gị aka? Lee ihe mere ka ndị mmadụ gara ahịa Yaba igosi iwe ha maka akparamagwa a.,"Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị ga-agwa gị na ihe mere ha ji asọ nsọ ịga ahịa azụta ihe bụ maka etu e si adọgharị ha n'aka ebe a ana-asị ha bịa gote ihe. Ndị otu kpọrọ onwe ha ""Market March"", gara n'ahịa Yaba dị na Legọs, igosi etu o dị ha n'obi gbasara ya bụ ndọgharị aka ụmụnwoke na-adọ ụmụnwaanyị n'ahịa. End of Twitter post, 1 @amaka_sandra1 kọwara etu ụfọdụ ndị si metụkwa ya aka n'ebe ọ gara ikwu ka akwụsị ndọgharị aka a na-adọ ụmụnwaanyị n'ime ahịa. @Sopzn kwuru na etu ndị mere ngagharịiwe si mee ya abụghị etu ha kwesịrị isi mee ya. O kwuru na ha gara ahịa ịkparị ụmụnwoke na-agụghị akwụkwọ, kama ikuziri ha etu ha ga-ezi na-akpa agwa ọfụma. O kwuru na ihe a ụmụnwaanyị a mere n'ahịa mere ka ha yie ndị iberibe. @Dikachim kwuru na ọ bụghị naanị ndị nọ n'ahịa na-eme ụmụnwaanyị ihe a, na ọtụtụ ụmụnwoke na-emekwa ya n'ụlọọrụ dị iche iche." egwuregwu-44396481,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44396481,Ndị Super Eagles na oji obi ha,"Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere ntụkwasị obi na ndị na-agbara otu egwu Naịjirịa bụ Super Eagles bọọlụ, mana kedụ ndị bụ ndị nkwado ha oge ha na-anọghị n'ọdọ egwuregwu?","Ka onye ọbụla na-etinye anya n'ihe gbasara ndị otu Super Eagles, e nwere ndị ha debere n'ụlọ na-akwado ha n'asọmpi ma na-ele anya mgbe ha ga-alọta ka ha nwee ike nọkọọ. Ndị ahụ bụ nwunye ha na ndị enyi ha nwaanyị. Ndị a bụ ndị na-agba ha ume ma ọ dị mma ma ọ dị njọ. BBC Igbo ga-egosi gị ndị a dị mkpa na ndụ ndị Super Eagles. Ndị ochee goolu 1) Ikechukwu Ezenwa Ochee goolu Ikechukwu Ezenwa lụrụ nwunye ya bụ Amaka n'afọ 2013. Ha amụtala ụmụ nwoke atọ. 2) Daniel Akpeyi Akpeyi bụ ochee goolu ndị Super Eagles lụrụ nwunye ya bụ Emmanuella n'afọ 2016. Ndị na-agba n'azụ: 3) William Troost-Ekong Troost-Ekong na-ejidere ndị Super Eagles azụ, na enyi ya nwaanyị ayịruola afọ anọ. Enyi ya nwaanyị dị ime nwa ga-abụ nwa mbụ ha. 4) Kenneth Omeruo Omeruo na-agbara ndị Super Eagles n'azụ, lụrụ nwunye ya bụ Chioma n'ọnwa Mee 2018. 5) Chidozie Awaziem Chidozie bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ na 2017. Lee foto ya na enyi ya nwaanyị bụ Obiageli. 6) Elderson Echiejile Echiejile lụrụ nwunye ya bụ Oghenevwemo n'afọ 2017. Ha mụrụ nwa ha nke mbụ n'ọnwa Maachị 2018. Ndị egwu etiti 7) John Mikel Obi Mikel na enyi ya nwaanyị bụ Olga Diyachenko ayịruola ihe ruru afọ ise. Ha mụrụ ụmụnwaanyị abụọ bụ ejima. 8) Onazi Ogenyi Onazi lụrụ nwunye ya bụ Sandra n'afọ 2015. Ha amụtala otu nwa nwaanyị. 9) Wilfred Ndidi Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2015. Ya na enyi ya nwaanyị bụ Chidinma ayịruola afọ abụọ. 10) Oghenekaro Etebo Etebo bidoro ịgbara Naịjirịa n'afọ 2013. Ya na nwunye ya bụ Isi Ebhota amụtala otu nwa nwoke. 11) Joel Obi Obi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2011. Ya na enyi ya nwaanyị amụtala otu nwa nwoke. Ndị na-agba n'ihu 12) Odion Ighalo Ighalo na nwunye ya bụ Sonia, alụọla ọtụtụ afọ. Ha mụtara ụmụ atọ bụ nwoke abụọ na otu nwaanyị. 13) Ahmed Musa Musa lụrụ Juliet n'afọ 2017 ka ya na nwunye ya nke mbụ na nne ụmụ ya abụọ bụ Jamila gbasara. 14)Victor Moses Moses lụrụ nwunye ya bụ Josephine n'afọ 2017. Agbamakwụkwọ ya na-abịa ka ha mụchara ụmụ abụọ, otu nwoke nke a mụrụ n'afọ 2012 na nke nwaanyị a mụrụ n'afọ 2015. Kedụ ndị ọzọ ị ma ụmụnwaanyị nọ na ndụ ha? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47382682,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47382682,Presidential Election 2019: Ihe anọ mere Atiku ji gbajọọ mmeri Buhari,Atiku Abubakar bụ onye zọrọ ochịchị n'okpuru pati PDP ekwuola na ya anabataghị mmeri Buhari meriri ya.,"Atiku sị na ntuliaka bụ nke kachasi jọọ njọ kemgbe ya bidoro mewe ihe banyere ntuliaka ma sị ndị kwadoro ya nọsie ike. Lee ihe ndị ọzọ o kwuru: 1) Atiku sị na nrụrụaka banyere ntuliaka nke ukwuu, ma sịkwa na nrụrụaka dị ka ihe akpara akpa tupu emewe ha. 2) Agbachịrị ndị na-akwado ya ma gbachapụ ha n'ime ntuliaka etu ekwesighi kwesị. 3) Eji ọgbaghara banye ebe ndị na-akwado ya kachasị nke ndị nchekwa hụrụ ma gbaa nkịtị. 4) Yabụrụ na o meriri n'ụzọ ziri ezi, ọ ga-ekele onye meriri ya ma nye nkwado ịhụ na obodo Naịjirịa gara n'ihu nke ọma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" mba-uba-42834491,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-42834491,Akpokpụtala ụmụaka anọ n'ọgba Thailand,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na akpọputala ụmụaka anọ n'ime ọgba Thailand bụ ndị nọ ebe ahụ kamgbe izuụka abụọ gara aga.,"Ụgbọala ambụlansị so enye aka na ọrụ Onye nta akụkọ nke bi na Bangkok aha ya bụ Florian Witulski bụ onye na enwetere anyị akụkọ ụmụaka a na ka esi azọpụta ha n'otu na n'otu. Ihe bụ foto ndị si na ebe ahụ apụta dị ka eji ụgbọelụ helikọpta ebuga ụmụaka ahụ ụlọọgwụ Ugbua dọkinta nwaamadi mba Ọstralịa bụ onye nọ n'ime ọgba ahụ ebe ụmụaka ahụ na onye nkụzi ha nọ bụ ụzọ kpọpụta ụmụaka abụọ ahụ esicheghị ike. Ka ọdị ugbua, otu natakụkọ Reuters kwuru na akpọpụtala isii n'ime ụmụaka iri na abụọ ndị ahụ ndị ka ọnyeisi ndị ọrụ ahụike jị ọrụ ahụ gwara ha. Nke a bụ sụpirisụpiri ya ka ọ dị ugbua na bekee n'akara Ihe bụ foto ndị si na ebe ahụ apụta dị ka eji ụgbọelụ helikọpta ebuga ụmụaka ahụ ụlọọgwụ Ọbaozi soshal midịa na ekpo ọkụ n'ọjịjị a na-aja ndị nọ na ọrụ ịzọpụta ụmụaka ahụ. Lekwa sụpirisụpiri ya na bekee eba Ndị ọrụ anyị na BBC Vietnamese zitere ihe onyonyo nke gosiri ka ụgbọelụ Helikọpta mbụ si bute ụmụaka ahụ akpọpụtara n'ime ọgba ahụ n'ụlọọgwụ. Ambulansi n'onwe ya erukwala ụlọọgwụ nke Chiang Rai nke dị nso ebe ọgba ahụ dị Onyeisi mba Amerika bụ Donald Trump ekwola na mba US na-akwado mba Taịland n'ọrụ ịzọpụta ụmụaka ahụ tọrọ atọ n'ime ọgba ịzụụka abụọ gara aga. Kedụ ihe ịze ndụ dị na-ịzọpụta ụmụaka a? Azọpụtara nwata nke bụ ngwangwa karịa ka atụrụ anya, nke na-arụtụaka na ya bụ ọrụ ataghị akpụ ka atụrụ anya. Ọ bụ idere mmiri ribidoro ụmụaka ahụ n'ime ọgba ahụ. A na-atụ ekwu na oke mmiri nwere ike izo ọzọ nke ga-eme ka idere mmiri ahụ mụbanwanye. Ka ọ dị ugbua o doghi anya mmadụ ole akpọpụtalara maka ụfọdụ na-ekwu isii mana onyeisi ọrụ ndị na-akpọpụta ụmụaka ahụ bụ Narongsak Osottanakorn kwara ndị nta akụkọ na ọ bụ mmadụ anọ ahụ zuru oke pụtalara. Onyendu ọrụ bụ Osottanakorn kwuru na ọ bụ mmadụ 90 aka siri ike na-igwu mmiri so n'ọrụ nzọpụta a. Iri ise n'ime ha bụ ndị Taịland ebe iri anọ ndi ọzọ sị ofesi. Akpọpụtara onye mbụ mgbe ọkụrụ elekere iri ụtụtụ a. Ụmụaka anọ ndị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ụgbụa na-anata ọgwụgwọ. Ọrụ a ga-amalite ọzọ n'ụtụtụ Mọnde. Nke a bụ onye agha ụgbọmmiri nke nwụrụ ebe ọ gara ịzọpụta ụmụaka ahụ. Akara twitter a na-akpọkụ oha na eze ka erubere ya bụ nwaamadị isi ncheta nke ọnwu. A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọa n'ụjụ ya." afirika-44429091,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44429091,Akụkọ Kachasị n'ụtụtụ a: G7 ewepụtala $3b ị kwalite ụmụnwaanyị,Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu ekwuola na Gọmentị etiti ga-emezu nkwa ha kwere ndị Naịja Delta n'ihe gbasara nchekwa obodo ha,"Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a Nke a bịara ebe ndị ntorobia ahụ na-ebo ndịagha Naịjirịa kwesiri ị chekwa ha ebubo ohi mmanụ agbidi. Ọzọ na Naịjiria Lagos steeti na steeti ndị ọzọ dị na ọdịda anyanwụ Naịjirịa etinyela ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike. Akwukwo e depụtara gbasara iwu a, nke gọvanọ Ambode binyere aka na-ekwu na ọ bụ iji kwanyere ụbọchị onyekwuoucheya ugwu o kwesiri. Ijeri dọla atọ maka ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị Lee ebe Malala Yousafzai gosiri nkwado ya maka okwu a na soshal midia. Mba Canada na mba ndị ọzọ nọ n'otu G7 ekwela nkwa ị wepụta ijeri dọlla atọ ị ji hụ na ụmụnwaanyị nwereike gụọ akwụkwọ dị ka ibe ha. Ego a ga-akwalite ngalaba ọgụgụ akwụkwọ na mba dị ịccheiche n'ụwa niile kachasi ebe ndị e nwere ọgbaghara . N'Egwuregwu, Otu bọọlụ mba Kamerun akpọrọ Lioness ejila ọkpụ iri asataghị otu merie otu bọọlụ mba Congo n'asọmpị ha gbara. Nke a mere na Lioness etozuola ị sonye n'asọmpị nke iko mba Africa ụmụnwaanyị. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45030412,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45030412,2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Imo steeti,"Dịka ntuliaka a ga-eme iji họpụta ndị ga-anọchi ndị mmadụ bido na 2019 ruo 2023 na-abịa nso nso, BBC Igbo chọrọ ịgba ndị chọrọ ịnọchite ndị Imo steeti n'anwụ.","N'ime ọnwa ole na ole gara aga, Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ kwuru na ndị ntorobịa nwere ike ịzọ ọkwa ọchịchị. Nke a mere ka obi kaa ndị ntorobịa, mee ka ha bido ịpụta n'igwe kwupụta ebumnuche ha gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị gọọmentị. BBC Igbo jụrụ ma e nwere ndị dị afọ 18-40 chọrọ isonye ọchịchị n'afọ 2019, lee ndị nke si Imo steeti. Ụlọomeiwu ukwu: Precious Uwadikaechere Nwadike dị afọ 38, bụ onye ntaakụkọ nwekwara ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ. Ọ bụ onye Ọlụ chọrọ ịnọchite anya 'Imo West' n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta 1. Chinedu Nnawuihe Onyegbula dị afọ 36, bụ Injina. Ọ bụ onye Nkwerre chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nke nta. 2. Obinna Ebirim dị afọ 32, bụ dọkịta Ọ chọrọ ịnọchite anya Mbaitoli/Ikeduru n'ụlọomeiwu nta Gọvanọ Dr Anthony Iroegbu Njoku dị afọ 37, bụ Injinia. Ọ bụ onye Ogbe, Ahiazu Mbaise, chọrọ ịnọchi Rochas Okorocha n'oche gọvanọ. Ụlọomeiwu nke steeti 1. Prince Ngozi Roosevelt Mbamara dị afọ 32, bụ onye ọkaiwu. Ọ bụ onye Amato-Amaraku chọrọ ịnọchite anya ndị Isiala Mbano n'ụlọomeiwu nke steeti. 2. Osuji Kemas dị afọ 30, bụ ọkachamara n'ihe gbasara azụmahịa ka o si gbasa ọrụugbo, nke Bekee kpọrọ 'agribusiness consultant'. Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Owerri North n'ụlọomeiwu nke steeti. Kedụ onye ị ga-akwado? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43722287,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43722287,Ha ga-eli Achuzia n'ụbọchị Satọde n'Asaba,Ha bidoola abalị ncheta Joseph 'Hannibal' Achuzia bụbụ onye amama dịka onye dike agha Biafra.,"Joseph Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 Achụzia bụbụ onye jibu ọkwa dịka 'Ikemba nke Asaba' nwuru n'ụbọchị iri abụọ n'isi n'ọnwa Feburuwarị n'afọ a, ọ dị afọ iri asatọ na itoolu. Abalị ncheta ya bidoro ụbọchị Tuusde, ha ga-eme ọzọ n'Owere na Asaba taa na echi tupu elie ya n'ụbọchị Satọde. N' okwu ya, na emume ncheta e mere n'Enugwu, onyeisi otu Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru na ọnwụ Achuzia bụ ohere Ndigbo niile egosi na ha bụ ụmụnne, dị n'otu na icheta mkpamkpa dabidoro umunne ha n'oge Agha."" Ejiofor Onyia, bụbụ onyeisioche komitii na-ahụ maka nkwadebe akwamozu ya gwara ndị nta akụkọ na ha na-atụ anya ndị gọvanọ niile na-achị steetị ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ụbọchị ha ga-eli Achuzia." afirika-43580151,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43580151,Ihe asaa ị kwesiri ịma maka ịgwọ ụra,"Ikwo ụra bụ ihe dị ebe niile ma na ọ bụghị ihe gba aka, onwere ihe na-akpata ya.","Amaghị ọnụọgụ mmadụ ole na-ekwoụra n'ụwa Ikwo ụra bụ mkpọtụ mmadụ na-eme na-amaghị ama oge ọ na-arahụ ụra. Ndị ọnụ na-eru n'okwu n' ahụike kwuru na ikwo ụra na-eme oge ikuku nwere nsogbu n'ime akpịrị mmadụ. Dịka Britishsnoring.co.uk, websait ọkachamara nike gbasara ikwo ụra, sị kọwa,ihe na-akpatakarịsị ikwo ụra bụ; oke ibu, ịṅụ mmanya,ise anwụrụ, ọrụ onye na-arụ na ọrịa dịka onye na-arụ eme a na-eme asbetos, egwupụta ihe maọbụ ebe a na-edowe ngwa ahịa(warehouse) ebe oke etum na-adị nwere ike ibute ụkwara na azụzụ nke ga-enuba onye ahụ n'ikwo ụra. Ọrịa ntị(ear infection), ọrịa mburupụta ụwa(congenital diseases) dịka Down syndrome nwekwara ike ibute ịgwọ ụra. Ihe ndị ị kwesiri ịma maka ikwo ụra: 1. Ndị na-ekwo ụra na-enwe nsogbu ahụike ugboro atọ karịa ndị na-anaghị ekwo ụra 2. Ikwo ụra na-esi n'agbụrụ. O nwere ike ọ bụrụ nna nna gị bunyere gị ya 3. Ndị na-edina ndị na-ekwo ụra nso kwuru na ha anaghị ehi ụra nkeọma, karịa elekere ato rue elekere ise 4. Ndị na-ekwo ụra na ndị ha na ha na-edina nso nwere ike inwe nti ike karịa ndị na-anaghị ekwoụra 5. Ọtụtụ dị na nwunye na-ese okwu kwuru na ọ bụ maka ikwo ụra 6. Ọ bụrụ na mkpọtụ ị na-eme oge i na-ekwoụa siri ike, ọ ga-abụ na i buru ibu nke ukwu 7. Ndị na-ekwoụra nwere ike inwe ọbara mgbalielu, ọrịa obi, ọrịa stok, ọrịa shuga na ọrịa abụba ugbo ise karịa ndị na-adịghị ekwoụra. Ọtụtụ na-eche na ikwo ụra anaghị akwụsị akwụsị mana ndị ọkachamara na-ekwu na o nwere ụfọdụ ihe i nwere ike ime iji belata ya maọbụ kwụsị ya kpamkpam: 1. Taa ahụ Ọ bụrụ na ihe na-akpata na i na-ekwo ụra bụ maka na i buru ibu karịa, ị mara na ị mara abụba nke nwere ike idi na-atọ gị n'olu maọbụ n'akpịrị oge ị na-ehi ụra. Ị nọ n'ahụike site na iri ezi nri nakwa imegharị ahụ(exercise) ga-enye aka gbochie ikwo ụra. 2. Belata ịnụ mmanya ike Mmanya na-eme ka akwara mmadụ zuo ike karịa oge mmadụ na-ehi ụra. Nke a nwere ike ịkpachi akpịrị ebe mmadụ si eku ume ga-eme na ikuku agaghị enwe ike gafe nkeọma. Ndị ọụ ahụike na-ekwu na mmadụ belata mmanya ike, i nwere ike i belata ikwo ụra. 3. Dina n'akụkụ gi Idina n'azụ nwere ike ime ka abụba dị mmadụ n'ire, nti na onu gbochie ebe ikuku si aba makwa apụta n'imi mmadụ. Ya bụ gbaa mbọ rahụ n'akụkụ gị. 4. Hichaa imi gị nke ọma tupu ilabaa ụra Ọ bụrụ na azụzụ na-eme gị ma imi gị ọkpọchiri akpochi, ị mara na i nwere ike ikwo ụra. Ya bụ gbaa mbọ zie imi gị nke ọma tupu ị laba. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-44119997,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44119997,Ndị Bishọp: 'Kwụsị ime ndị ọchịehi ka ụmụnna gị',Ndị isi ụka Angịlịkan na Naijiria ekwuola na etu onyeisiala siri na-eso okwu nsogbu ndị ọchịehi na Naijiria jọgburu udele ma sigbuo nkapị n'isi.,"Bishop Alex Ibezim bụ Bishọp ndị Angịlịkan na Ọka Dayasis Ha kwuru na otu guolala puku kwuru puku mmadụ e kwesịghị ka ọ na-eme ha ka ha abụ ụmụnna ya. Bishọp nke Angịlịkan n'Ọka Dayasis bụ Alex Ibezim kwuru nke a ka ndị Bishop mechara Sinọd nke afọ 2018 na St. Peter's Anglican Church, Amawbia, Anambra steeeti. Synod bụ ọgbakọ ndị Bishop ndị Angịlịkan na-enwe kwa afọ. End of Twitter post, 1 N'ozi ha wepụtara nke ụlọakụkọ Punch gbara n'anwụ, ndị bishọp tụrụ arịrị na site na'afọ 2014 rue 2018, na ndị ọchịehi egbuola ihe karịrị mmadụ 1,229 dịka mkpamkpa ahụ kacha metụta Benue, Taraba, Nassarawa, Plateau, Kaduna nakwa Katsina steeti. Ha sị, ""Ha na-eji ngwaagha kara aka wakpo ndị obodo ha bụ n'obi oge ha adịghị nkwadobe ,ọkachasị n'abalị maọbụ ụbọchị ụka oge ha nọ n'ụlọụka, na-egbu mmadụ na eleghị anya n'azụ, na-agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ ma na-ezukwa ihe. ""Nke kachasị obi mwute bụ ka ndị ogbuochu a sị akpa ike na- echeighị maka iwu alal na kwa ndụ ndị mmadụ. Ndị uweojii na ndị agha nọkwa ka ngwere dara elụ na enweghị ike ọbụla ịzọ ndị a na-egbu na be ha."" ""Ikekwa, anyị kwesiri ịjụ ndị uweojii na ndịagha ihe mere na ha enweghị ike ichekwa ndị ọrụugbo n'aka ndị ọchịehi. Ọ bụ ezie na ndị agha ọlụọla Fulani ka nwe ngwaaha kara aka ma kakwa ndị uweojii n'ọnụọgụgụ? ""Gịnị mere o ji e siri gọọmenti etiti ike imeri iyiegwu nke ndị ndị agha ọlụọla Fulani? Kedụ ndị na enye ndị Fulani ọchịehi ngwaagha ha ji ememina ndị naijiria nọrọ onwe ha?"" Ọ gbara ndị sinọd gharịị ihe mere na onyeisiala Muhammadu Buhari gbara nkịtị n'ihe na-eme dịka ha kwuru na ike ozi nkasi obi na ogolo okwu a na-ezigara ndị ihe mere akwụla ndị Naijiria. Ndị bishọp a ndị katọrọ agha Buharị na-ebuso mmerụka ma sị na agha ahụ na ele anya n'ihu, kugidekwara agwa ọchagbute-ọchaghịgbute nke ndị ndọrọndọrọ ọchichị dịka ntuliaka 2019 na-abịa nso. Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-43837524,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43837524,Arsene Wenger ga-ahapụ Arsenal tupu nkwekọrịta ha akwụsị,"Arsene Wenger bụ onye nchịkọta ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ga-ahapụ ha na mgbe na-adịghị anya, were weta njedebe ọnọdụ afọ 22 ọ nọ na ya bụ otu egwuregwu.","Ndị na-akwado Arsenal chọrọ ka Arsene Wenger pụọ ga-enwe aṅụrị Wenger bụ onye mba France, ga-akwụsị ọrụ n'agbanyeghị na ọ fọrọ naanị otu afọ ka nkwekọrịta ya na ndị nwe Arsenal nwere gwụ. Ndị Arsenal, bụ ndị e ji Gunners mara, nọ n'ọnụọgụ isii n'usoro Premier League nke afọ a, nke mere na ha nwereike ghara iso gbaa Champions League nke afọ na-abịa. Nchekwube ha nwere ugbua isonye na Champions League bụ ma ọ bụrụ na ha bulie iko nke Europa League afọ 2017/2018 a. Wenger, bụ onye dị afọ 68, ritere iko Premier League atọ na iko nke FA asaa, na njem ya na Arsenal. ""E kele m unu maka ohere m nwetere ịrụ ọrụ n'Arsenal,"" Wenger kwuru. ""E duru m otu egwuregwu a etu o kwesịrị. ""A nam agwa ndị hụrụ Arsenal n'anya ka ha jide ihe ejiri mara Arsenal nke ọma."" Ihe ndị nkwado Arsenal na Naịjirịa kwuburu maka Wenger Mmadụ dịka Rauf Aregbesola bụ gọvanọ nke Oshun steeti kwuru na Wenger kwesiri itinye akwụkwọ arụkwaghị m. Banky W bụ onye oti egwu tinyekwara ọnụ n'okwu a. O kwuru na Wenger chọrọ ịnwụ n'ọrụ dịka onye nchịkwa Arsenal jiri ya maa atụ dịka onye chịburu Zibabwe bụ Mugabe. Onye egwu Patoranking gwakara BBC Igbo n'oge agbara ya ajụjụ ọnụ na naanị ihe mwute ya nwere na ndụ ya bụ oge ya na-etufu ikiri egwu bọọlụ ndị Arsenal ma emesịa ha gbawa ya obi. Patoranking bụ ọkụegwu amama n'ala Naijiria Kedu ihe a na-ekwu na Soshal midia ugbua? Kelechi Anyikude eji ""Kelechi Arsenal"" mara gwala Wenger daalu maka ihe nrota niile onyere ndị nkwado Arsenal. Onye nkwalite okwu na Twitter a ma ama bụ JJ. Omojuwa kelere Wenger sị ya daalụ Ma gakwa n'ihu kwuo na ọpụpụ Wenger dị ka mmekọrịta enyi na enyi na abịa na njedebe, ọ na ewe ndị niile ometụtara iwe. Ha bụ na Arsene Wenger ka na-enweta ezigbote nsọpụrụ site n'aka ndị hụrụ otu egwuregwu Arsenal n'anya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" afirika-45293493,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45293493,Lai Mohammed : Ọ bụghị eziokwu na gọọmenti etiti enweghị ihe o mere n'ala Igbo,N'okwu ya oge ọ gara nkuzi maka ndị ahọpụtara ga-agbara Muhammadu Buhari mbo ịzọ ọchịchị ọzọ n'okpuru ọchịchị ime obodo dị na Kwara steeti.,"Lai mohammed gọrọ n'ebubo ndị gọvana ọwụwanyawụ boro na ọchịchị nọ ugbua gbakụtara Ndigbo azụ, sị na mpaghara ọbụla nwere ihe ha ketara n'ọrụ ọchịchị Muhammadu Buhari na-arụ. O kwuru na ha ga-edepụta ọrụ dị 69 nke gọọmenti etiti ji n'aka n'ala Igbo, o kwuru na dịka ndị mpaghara ndị ọzọ, Ọwụwanyanwụ Naịjirịa nwetara ego karịrị ijeri naịra iri na isii (N16.6 Bn) site n'ego mbite Sukuk. End of Twitter post, 1 Ọrụ ndị eji n'aka dị n'ego Sukuk gụnyere akwammiri Naịja nke abụọ, okporoụzọ awarawa sị Ọnicha gawa Enugwu, nke si Enugwu gawa Pọtakọtụ nakwa akụkụ ya nke sị Aba gawa Pọtakọtụ. O kwuru n'ezie na ọchịchị ndị gara aga emeghị Ndị Igbo nke ọma n'ihe gbasara iwu ụzọ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. "" Ọ bụrụ na ha mere ya, o nweghị onye ga na-atụ arịrị ugbua."" ọ gara n'ihu sị, "" Ọ dị mma ị sị ka e mee karịa mana ọ dịghị mma ị sị na onwebeghị ihe e mere."" Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-54310073,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-54310073,Brighton Vs Man United: Penariti azọọla Man United ọzọ dịka oshimiri Brighton chọrọ iri ha,Otu bọọlụ Manchester United na Brightom zutere onwe ha taa na asọmpị Premier League.,"Mgbe ya bụ asompi na-ebido ka ndị otu Brighton gosiri na ha abịaghị igwu egwu dịka shọtụ Leandro Trossard kụrụ n'ọsịsị post were pụo. N'ime nkeji iri na asatọ ka ndị Brighton gbara mbọ ịnye goolu mana chi na-enye onyinyi goolu eleghị ha anya. Na nkeji iri abụọ na abụọ ka Bruno Fernandes ritere yelo kadị maka etu o siri gbaso Neal Maupay bọolụ. N'ime nkeji iri na atọ, mbọ niile ndị Brightom gbara ịnye goolu kụrụ na baa postu ndị Man Utd. Ndị ManUtd nyere goolu na nkeji iri atọ na atọ ma Marcus Rashfords nọ offside nke mere ka akagbuo goolu ahụ. Na nkeji iri atọ na asatọ ka ndị Brighton nwetara Penariti nke Neal Maupay ji nye goolu. Nemanja nke Man Utd reitkwara yello kadị na nkeji iri anọ na otu dịka ọ tinyere Aaron Connoly n'anya. Ndị otu ManUtd nwetara goolu iti aka n'obi mgbe Harry Maguire nyere goolu na nkeji iri anọ na anọ. Na nkeji iri ise na otu ka ndị ManUtd nyere goolu mana VAR gụpụrụ ya. Ọ dịka ọ kpalịrị iwe Rashford nke mere ka ọ kpakasịa ndị otu Brighton were gbakaa netị ha na nkeji iri ise na otu. Ndị Brighton zọpụtara onwe na nkeji iri itolu na ise mgbe Solly March nyere goolu nke abụo. Kama chị penariti zọrọ ndị ManUtd ọzọ dịka ha nwetara penariti" afirika-54086568,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54086568,Ugboro ise a wakporo ndị uweojii na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ọdịnso a,"N'ime izu ụka atọ gara aga, ndị omekome awakpola ndị uweojii na mpaghara ọwụwa anyanwụ ihe ruru ugboro anọ.","Ihe dị otu a emeela n'opekata mpe, steeti atọ na mpaghara ahụ. Ndị ekperima a na-akụri ụlọọrụ na ụgbọala ndị uweojii ma tinye ha ọkụ. Lee ebe ya bụ ihe mere: Egbu - Owere, Imo steeti Ụfọdụ ndị ekperima wakporo ndị uweojii n'Egbu, dị n'Owere, isi obodo Imo steeti. Ha ji obejiri mma merụọ otu n'ime ndị uweojii a ahụ ma nara ya egbe ya. Ndị mmadụ gbatara buru onye uweojii ahụ merụrụ ahụ gaa ụlọọgwụ. Owere-Nkworji - Nkwere, Imo steeti N'ụbọchị Mọnde, abalị asaa nke ọnwa Sepụtemba, ndị omekome wakporo ndị uweojii nọ n'Owere-Nkworji nke dị n'okpuru ọchịchị Nkwere, Imo steeti. Dịka ndị ntaakụkọ Punch si kwuo, ndị ahụ ji mma obejiri gbukasịa otu n'ime ndị uweojii ahụ, nara ya egbe ya, ma mụnye ụgbọala ahụ ọkụ. E bugara onye uweojii ahụ ụlọọgwụ dị n'Orlu mana o mechara nwụọ n'ụbọchị Tuzde. Onyeisi ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Isaac Akinmoyede kwuru na mwakpo ndị a mere eme, mana o nweghị onye nwụrụ na ya. Ohafia - Abia steeti Foto ochie na-egosi ụgbọala ndị uweojii na-agba ọkụ Ndị ekperima wakpokwara ndị uweojii n'Ohafia, Abia steeti, n'ụbọchị Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Sepụtemba. Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ John Okiyi-Kalu kwuru na ya bụ ihe mere oge mmiri na-ezo n'ụtụ Mọnde, na mpaghara Okagwe. N'ime ndị uweojii ise ya bụ ihe metụtara, mmadụ anọ merụrụ ahụ ebe otu onye nwụrụ. Okiyi-Kalu kwuru na nnyocha amalitela ịmata ndị rụrụ ala ahụ. Ogui - Enugwu N'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ ka ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ 'Unity Police Station'. Ụlọọrụ a dị n'ụzọ awarawara si Enugwu gawa Opi-Nsukka. Ya bụ mwakpo mere n'elekere iri nke abalị Akụkọ kwuru na ndị ekperima ahụ buuru egbe dị n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ laa. Ụfọdụ kwukwara na ndị uweojii abụọ nwụrụ na mwakpo ahụ. Abakpa - Enugu Ndị ekperima wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ogui, Enugwu. Nke a mere n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ. Akụkọ kwukwara na ọtụtụ egbe ndị uweojii ka ndị ekperima ahụ buuru laa. Gọọmentị Enugwu kwuru na mwakpo ahụ mere n'eziokwu mana ha ekwughị ma o nwere onye nwụrụ. Gịnị kpatara nke a? Gọvanọ Enugwu bụ Ifeanyi Ugwuanyi kpọrọ ọgbakọ ndịọrụ nchekwa n'ihi oke mwakpo ndị uweojii na steeti ahụ Izuụka atọ gara aga ka ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ 'Department for State Services' wakporo ndị otu 'Indigenous People of Biafra' ebe ha na-eme nzukọ. Ndị DSS kwuru na ndị otu ha abụọ nwụrụ na ya bụ mwakpo, ebe ndị Ipob kwuru na ndị nke ha mmadụ iri abụọ na otu nwụrụ. Ka ya bụ ihe mechara, onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na ha ga-abọ ọbọ ndị nke ha e gburu. Mana onweghị ihe ọbụla gosiri na ọ bụ ndị Ipob na-awakpo ndị uweojii Chetakwa na ndị ohi na ndị ntọ na-enyebu nsogbu na mpaghara ọwụwa anyanwụ tupu oge a. BBC Igbo na-agba mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba ka o tinye ọnụ n'okwu a. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ụlọ ngalaba ụgbọ olokoa n'Ukwuaji" afirika-50149659,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50149659,Davido: Unu ga-atakwute ya kọnkịrị n'ụlọmkpọrọ - Davido,Otiegwu Daivdo aṅụọla iyi na ụmụagbọghọ abụọ boro ya ebubo ịtụwa otu n'ime ha ime ga-ahuju anya.,"Ihe onyonyoo na-efegharị na soshal midia gosiri ụmụagbọghọ abụọ na-ekwu na ọ bụ Davido tụwara otu n'ime ha ime ma gọlahụ ya. Ha kpọrọ Davido iyi elu na ala ma kwuo na ha na ya ga-etinye ụkwụ n'otu trawụza ma ọ kachie ntị na-agọ agọ. Nke a wutere Davido, onye ezigbo aha ya bụ David Adeleke, nke ukwu. End of Twitter post, 1 Ya mere o ji foro ntutu taa na ọ ga-agbarịrị ụmụagbọghọ ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe. Davido kwuru na ụmụagbọghọ ahụ ga-akwụ ya ijeri naịra iri atọ tupu e si n'ụlọmkpọrọ tọhapụ ha. O kwuru na ọ ga-akwụ onye ọbụla ga-enyere ya aka ịchọta ha otu nde naịra. E mechaa, Davido kwuru na ya achọtala ha. Ugbua, ụmụagbọghọ ahụ ekwuola na ọ bụ egwuregwu ka ha na-egwu. Ha kwuru na ha ma ụma kwuo ihe ha kwuru iji kpaa ndị mmadụ ọchị. Mana Davido achọghị iji ntị anụ nke ahụ ma ncha. Ihe Davido dere n'akara 'instagram' ya O depụtara n'akara 'instagram' ya na ya agaghị edi ihe ahụ ụmụagbọghọ ahụ mere. ""Ọ bụ ihe a ka ụnụ na-enye nwunye m ka mụrụ nwa ọhụrụ?"" Cheta na enyi nwaanyị Davido bụ Chioma mụtaara ya otu agadaga dimkpa na nsonso a. Buhari na Putin anajiela aka Buhari na Vladmir Putin Onyeisiala Muhammadu Buharị na onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin zutere ma najie aka taa dịka ọgbakọ Russia-Africa Summit biiri ọkụ. Buharị na ọtụtụ ndị isi gọọmentị mba Afrịka ndị ọzọ na-esonye n'ọgbakọ ahụ nke ga abịa n'sisi njedebe n'ụbọchị Fraịdee. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi otu onye Ihe mberede a mere n'elu akwammiri Otedola Ihe anya mmiri mere taa n'okporoụzọ awara awara si Legọs gawa Ibadan. Ihe mberede okporoụzọ tara isi otu onye ma merụọ onye ọzọ ezigbo ahụ mgbe ụgbọala bu container kụpịara otụtụ ụgbọala na-agara onwe ha. Ndị ọrụ nchekwa ụzọ kwuru na o nwere ike ịbụ oke mmiri zoro n'ụtụtụ Wenezdee na Legọs kpatara nke a. A hụrụ ozu mmadụ 39 na UK Ụgbọala a hụrụ ozu mmadụ 39 n'ime ya Ndị uweojii nwụchiri ụgbọala gwongworo bu ozu mmadụ iri atọ na itoolu n'obodo Essex nke dị na mba UK n'ehihie taa. Aka akparala nwata nwaokorobịa nya ya bụ ụgbọala wee si mba Bulgaria wee bata UK n'ụbọchị Satọdee. Ndị uweojiikwuru na ọbụ ndị ọkenye iri atọ na asatọ na otu nwata ka a hụrụ ozu ha n'ime ụgbọala ahụ. Ha na-agbalịzi ugbua ịmata ndị e bu ozu ha n'ime ụgbọala ahụ. N'egwuregwu Dika goolu zoro ka mmiri na asọmpi Champions League ụnyaahụ, onye ma ihe ga-eme taa. Chelsea na Ajax na-akwata ya ugbua, Liverpool ga-ezute Genk, ebe Barcelona ga-ezute Slavia Praha. N'asọmpi ndị ọzọ, Inter Milan na Borussia Dortmund ga-akwata ya, Olimpique Lyonnais ga-ezute Benfica. Agbatiala ụbọchị nrụcha ọdọụgbọelụ n'Enugwu Ibe anyị o, a sịzịkwa na ọ bụ n'ọnwe Apreelụ 2020 ka a ga-arụcha ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam dị n'Enugu. Minista nọ n'isi ụlọọrụ ahụ bụ Hadi Sirika sị na ya agaghị atụrụ ndị mmadụ asị na ya gaghaị arụcha ya bụ ọdọụgbọelụ na Disemba dịka ha kwuburu mana ya ga-eburu isi ụlọọrụ ya ga-gwunye n'Enugu ịhụ na ha rụchara n'Apreelụ. Minista kwuru nke a mgbe ọ na-akọwara ndị kọmitii na-ahụ maka njem ụgbọelụ maka ego ha mapụtara itinye n'ọrụ na-afọ 2020. O kwuru na maka ya bụ ọkpụrụkpụ ego onyeisiala Muhammadu Buhari tinyegoro aka na ya maka ya bụ ọrụ, na ndị ọrụ ngo ga-amalite ya bụ ọrụ mgbe adịghị anya. O kwuru na Onyeisisala enyela ikike ka ndị niile ya bụ ọrụ metutere malite ọrụ ha ozugbo. Sirika kwukwere na ya bụ ọdọụgbọelụ ga bụ okaibe mgbe a ga-arụcha ya. Ọgbaghara ịkpaoke agbụrụ na Saụt Afrịka Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka Unu ahụlanụ o, emeruola mmadụ anọ ndị Naịjiria ahụ na ọgbaghara ịkpaoke agburu ọzọ na Saụt Afrika. Onyeisi ndị Nigerian Union South Africa bụ Adetola Olubajo kwuru na agbara ụlọahịa ndị mmadụ ọkụ na ya bụ ọgbaghara bidoro na Mpumalanga Province ụnyahụ. Nke a na-abịa ka onyeisiala Muhammadu Buharị na ọgbọ ya nke Saụt Afrika bụ Cyril Ramaphose nwechere mkparịta ụka na Saụt Afrịka maka ọdịmma mba abụọ ahụ. Egwu adagharịala na Brexit N'ofesi, onyeisi mba Briten bụ Boris Johonson ekwuola na ya ga-enwe ntuliaka ọhụrụ ma ọ bụrụ na Europian Union nyezuo ha ọnwa atọ. Chete na ụlọomewu mba ahụ jụrụ na ha agaghị akwado Johnson na nkwekọrịta ha na EU nwere n'izu uka gara aga. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45051736,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45051736,Akụkọ kachasị na mgbede a: Idemmiri emebiala ụzọ Igbo,"Ndị Mịnịstri na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti, otu ndị gbatagbata gọọmenti etiti (NEMA) na nke steeti (SEMA) gara njem nleta n'Awka, Onicha na ebe ndị ọzọ ide mmiri mebiri ụzọ","Okporo ụzọ MCC, Urata n'ime Owere na steeti ahụ. Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Michael Okonkwo gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ha gara ileta mkpamkpa ide mmiri kpara n' Ezi Mgbemena nke dị na Ọnịcha. Ndị gbaara ọsọ pati enwela nzuko mbu Ọtụtụ ndị APC agbafela PDP Ndị isi ọchịchị ụlọomeiwu nakwa nke steeti si pati APC wụfee PDP agaala ọgbakọ ndị isi ọchịchị PDP nke mbụ ha kemgbe ha wụfere. Ndị ọchịchị a gụnyere Bukola Saraki, Rabiu Kwankwaso, Aminu Tambuwal, Samuel Ortom nakwa ndị ọzọ. Popu si onye egbula ibe ya ọzọ Popu Fransis wetere ọtụtụ mgbanwe na ụka katọlik Pope Francis bụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile agbanwela nkuzi ndị ụka ahụ ka o megide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghị ihe ọbụla onye ahụ mere. O kwuru na ụka Kraịst niile ga-agba mbọ ịhụ na akachapụrụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ na mbaụwa niile. N'egwuruegwu,NFF ekwetala ka ha na Giwa kpee udo Ọchịchị Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF ga-abịa n'isi njedebe na Sept. 30 N'iji gboo nsogbu dị n'etiti ha, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF adịla njikere ibuli mmachi amachiri onye otu ha bụ Chris Giwa. Ha kwuru na nke a ga-adị ire ma ọ bụrụ na Giwa gbahapụ mkpọpụ ọkpọpụrụ NFF n'ụlọikpe. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra." afirika-50446451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50446451,Fire Outbreak: Ọkụ agbagbuola Fada n'ụlọụka Katọlik,"Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe mere otu ụkọchukwu ọkụ gbagburu n'Nnewi, Anambra steeti.","Ọkụ agbagbuola otụ ụkọchụkwụ Katọlịk a kpọrọ Fada Edmond Nwagbala n'ụlọụka St. Peters Claver Katọlik dị na Nnewi Ichi Uruagu dị n'Anambra Steeti. Ndị bi nso ebe ihe mere kwuru na ha n'ụlọ ha nụ ka ihe gbara ha gbapụta ị mara ihe dara ụdọ ahụ were hụ ọkụ na-agba n'ụlọ Fadaa ahụ 'ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ Satọdee. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed sị na ọkụ a malitere ịgba n'elekere anọ nke isi ụtụtụ 16 Nọvemba, 2019. Ọkụ a na-amabeghi ihe kpatara ya gbara ebe obibi ụlọụka ahụ bụ ebe Fada Edmund Nwagbala dị afọ iri isii bi ma gbaa ya nke a na-amaghị onye ọ bụ. Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga Haruna sị na ndị ọrụ nchekwa uweojii ngalaba Otolo nakwa ndị na-agbanyụ ọkụ wụchiri ebe ahụ bịa gbayụọ ọkụ a. Ngwa ngwa ebu Fada Edmund gawa ụlọọgwụ mana e kwupụtara ọnwụ ya, e tinye zie ya n'ụlọozu maka nyocha. Ọ sị na kọmishona ndị uwojii n'Anambra bụ John B. Abang enyela iwu ka a malite nyocha tara ọchịchị banyere nke a. Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu N'aka nke ọzọ, a tọrọla Fada ọzọ n'Enugwu Ndị ntọrị tọrọ Fada Theophilus Ndulue, nke ụlọụka St. Patrick Katọlik Ihuonyia, Amansi-Odo, dị n'okpuruọchịchị Ezeagu n'Enugwu Steeti. Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde 15 Nọvemba, 2019, Mgbe o si nzukọ ndị ụkọchukwu na-alọta. Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọụka a bụ Fada Benjamin Achi mere ka a mata nke a. Ọ sị na a tọrọ Fada Theophilus na onyeisi ndị ụmụnwaanyị bụ ha mechara tọhapụ dịka otu awa gachara mana Fada a ka nọ n'aka ndị a. Ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Theophilus maọbụ ndị isi ụlọụka maka ịjụ ajụjụ n'isi ya. Nke a ga-abụ ugboro ise ndị ntọrị na-atọrọ ndị ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Steeti." 45473849,https://www.bbc.com/igbo/45473849,MTN: Anyị kpụpụrụ CBN ụlọikpe iji chekwa ego akụnaụba ndị tinyere ego na ụlọọrụ anyị,"Ụlọọrụ ekwenti MTN, agala ụlọikpe inweta ikike iji kwụsị ụlọakụ etiti CBN na ọkaiwu nke gọọmenti etiti imezu ihe ha kwuru maka MTN ịkwụ ụgwọ iwu eriri ha.","N'akwụkwọ ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara n'igwe okwu Twitter ha, ụkwụ ahụ ha zọpụrụ bụ iji chekwa akụ na ikike dịrị ndị jịkọrọ aka nwere ụlọọrụ ahụ nke a na-akpọ shareholders na bekee. Ụlọakụ etiti bụ CBN riri MTN iwu ego dị ijeri dọla 5.2 maka mbupu ego na Naijiria n'ụzọ ezighị ezi. CBN boro MTN ebubo ibupụ ọkpụrụkpụ ego karịrị ijeri dọla 8 n'ụzọ akwụghị ọtọ ma nye ha iwu ka ha kwụghachi ya ma kwụọ ụgwọ iwu ijeri dọla 5. Ha rikwara ụlọakụ anọ iwu maka inyere MTN aka n'ime nke a. N'otu aka ahụ, ọkaiwu nke gọọment etiti (Attorney-General of the Federation) gwara MTN ka ha kwụọ ijeri dọla abụọ bụ ego ụtụisi ruru gọọmenti etiti. Ha sịrị, ""Nke bụ eziokwu bụ na MTN ebupughi ego ọbụla n'ụzọ megidere iwu. MTN na-agbaso iwu Naịjirịa n'ụzọ nille. "" N'ọnọdụ dịka nke a, ọ dị mkpa na agbara okwu niile n'anwụ ka o doo gọọmenti, ndị na ahazi ka ihe si aga na mgbasaozi nakwa ụlọọrụ anyị anya. ""Mana dịka ihe ndị a edoghị anya, ya mere ka anyị jiri chọ ka ụlọikpe tinye ọnụ na ya."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47625272,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47625272,Minimum Wage: Kedụ steeti ga-amalite ikwu ya?,Ọ bu eziokwu na ọtụtụ ndị ọrụ na-amali elu maka mkpebi Sineti nyere gbasara ụgwọ opekatampe,"Ndịọrụ Nigeria na-esi ọnwụ na ụgwọ opekatampe ga-abụlrịrị N30,000 Ha kwekọrịtara na ọ bụ puku naira iri atọ mana ajụjụ ndị ozọ na-ajụ bụ kedụ steeti ga-ebuzo malite ya bụ atụmaatụ? Etu ọdị ugbua, kọmishọna mgbasa ozi n'Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na kamgbe ka steeti ahụ kpebiri na ha ga-akwụ ya bụ ụgwọ ọhụrụ Adinuba a gwaghị BBC Igbo mgbe ha ga-amalite mana o kwuru na steeti ahụ nwereike ịbụ nke mbụ ga-akwụ ya bụ ụgwọ. Gọọmenti Imo steeti site n'ọnụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi soshal midia Rochas Okorocha kwuru na ha enwebeghị ihe ha nwere ikwu maka mgbe ha ga-amalite kwụwa ụgwọ a. Etu a ka ọ dịkwa n'akụkụ gọọmenti nke Abia steeti. Kọmishọna mgbasa ozi n'Ebonyi steeti ebughị ekwenti ya mgbe BBC Igbo kpọrọ ka ha mata ebe ha kwụ na mmalite ya bụ atụmaatụ. Gọọmenti Enugu steeti site ọnụ kọmishọna mgbasa ozi ya kwuru na ha di njikere ikwụ ụgwọ ọnwa ọhụrụ a ma onyeisiala binyecha aka n'akwụkwọ gbasara mkpebi sineti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54574656,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54574656,Aka akparala onye uweojii gbara Joy Ndụbụeze egbe n'ọnụ,Aka ndị uweojii Legọs Steetị akparala onye otu ha ji egbe gbajasịa enyi ya nwaanyị ọnụ n'ihe dịka izuuka abụọ gara aga.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Olamuyiwa Adejobi gwara BBC na ya bụ nwoke nọzị na mkpọrọ ndị uweojii esi rọọdụ n'ime. Ana Ndubueze bụ nne Joy Ndubueze kwara arịrị etu ọyị nwoke nwa ya nwaanyị si were egbe gbarie nwa ahụ ọnụ. Ha mere ka BBC Igbo mata na nwoke a bụ ọyị Joy bụ onye uweojii. Na ọ kpọọrọ Joy gaa n'akụkọ ebe ndị mmadụ na-anọghị ma were egbe ka ọ gbagbuo ya. Mana ekwentị Joy kụrụ, ka Joy sị ka ọ zaa ya egbe ahụ bịara gbaa ya n'ọnụ ma gbarie eze, ire na agba ya. Joy dara n'ala, nwoke ahụ gbaa ọsọ mana ndị mmadụ bịara buru Joy gawa ụlọọgwụ. Kirie ihe mere n'uju. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44166079,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44166079,Akụkọ kachasị mkpa: 'Anyị ga efe ọkọlọtọ Biafra' - BIM,"Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ncheta ụbọchị Biafra,","Otu na-azọ nwereonwe Biafra bụ BIM ekwuola na ndị agha Naịjiria agaghị egbochi ha ị bunyi ma fee kwa okoloto Biafra maka ncheta ụbọchị ya n'onwa mee. Otu ahụ na-akwado kwa ị fee okoloto a n'obodo dị icheiche n'ala Igbo. Ebe ọzọ na Naịjirịa, Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu Gọọmentị etiti enyela iwu ka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara nrị na ọgwụ bụ NAFDAC laghachị n'ọdọ ụgbọmmiri dị icheiche. Nke a bụ ka ha nweike mee ngwa ahịa na-abata nyocha zuruoke maka ndị na-esi ụzọ azụ ebubata ọgwụ Codeine. N'akụkọ ofesi, Orue la na nchịkọta nkwado niile gbasara alụm di na nwunye n'etiti Meghan Markle na Okparaeze Harry ga-eme n'ụlọụka St George's dị n'ime obieze Windsor ụtụtụ echi. Ezenwaanyị Elizabeth bụ onye nyere ha ikike ị gba akwụkwọ n'ụlọụka ahụ. Ọ bụ kwa ezinaụlọ Harry ga-akwụ ụgwọ agbamakwụkwọ ahụ. N'Egwuregwu, Akpọpụtala aha onye ọgbaa bọọlụ ama ama bụ Cristiano Ronaldo dịka onye ga-eso otu bọọlụ mba Portugal aga asọmpị iko mba ụwa. N'otu aka ahụ otu egwuregwu bọọlụ naịjiriịa nke nta bụ Flying eagles ga-ezute ibe ha nke maba Guniea Bissau echị maka ị tozu asọmpị iko mba Afirịka. Gee nkeji ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ga-amasi gị:" afirika-52024450,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52024450,Imo state: Onye uweojii gburu di na nwunye gbuo onwe ya,Otu onye uweojii n'Imo steeti egbuola di na nwunye gbukwaa onwe ya.,"Kenneth Enamika sị na nwunye ya bụ nwoke bụ Oluchi Aputanze kwere ya nkwa alụmdi tupu ọ hapụ ya ga lụọ Cajethan Aputanze. Enamike bụ onye hapụru edemede tupu o gbuo onwe ya dere na o nyere Oluchi otu narị naịra na iri na ise (N150,000) ka o kwechere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ya agbahapụ ya gaa lụọ onye ọzọ. Olando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti kwuru na ""mgbe Kenneth chọpụtara na Oluchi alụọla dị ọzo, ọ gara be ha ịgba ya ụgwọ ego ahụ o nyeburu ya"". Ebe ahụ ka di Oluchi bụ Cajethan Aputanze jiri yiwa ya egwu sị na ya ga-eji ọtụmọkpọ gbuo ya ma ọ hapụghị nwunye ya aka. ""Ya meziri enneth ji were egbe ya gbagbuo Oluchi na di ya, gbukwa onwe ya n'otu ahiri ahụ. Ikeokwu sị na ozu mmadụ atọ a ndị n'ọba ozu ụgbụa dịka ana enyocha ka amatakwụọ ihe mere ha. Jamb na ụmụakwụkwọ Ụlọọrụ ule akwụkwọ ịbanye mahadum dị n'aka bụ Joint Admission and Matriculation Board (Jamb) ekwuola na ụmụakwụkwọ Ọwụnwa Anyanwụ kacha gbaa mgbọ n'ụle ha lechere n'izu gara aga. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Fabian Benjamin gwara BBc Igbo na n'ime mmadụ otu narị na iri asatọ (180) ha jidere maka ịzụ ohi n'ụle, na Naịjrirịa niile, na ndị ejidere n'ala Igbo kacha. Ndị si Imo, Anambara na Enugwu steeti kachasị gbaa gbọ na ule 'Jamb' nke afọ a . Ndị na-eso ha n'aghụghọ n'ụlọ bụ ndị Abia, Adamawa, Jigawa, Kaduna, Kano, Kwara, Ondo, Oyo, nakwa Osun. Mmadụ ọle ejidere gbara mgbọ n'ule Jamb Abia - mmadụ 8 Anambra - mmadụ 12 Ebonyi - mmadụ 3 Enugwu - mmadụ 12 Imo - mmadụ 26 Gana na Coronavirus N'Afrịka, mba Gana etiela mkpụ maka otu ọrịa coronavirus sị agbasa be ha. Naani taa bụ Tuzde, a chọpụtala mmadụ iri abụọ na anọ bu ya bụ ọrịa nke bunitere ọnụọgụgụ ndị bụ ya bụ ọrịa na iri ise na abụọ (52). Indịa emechiela ezi na ụzọ N'ofesi, onyeisiala mba India bụ Narendra Modi agwala ndị be ya ha chefuo ịpụ ezi rụrọ abali iri na otu maka egwu coronavirus. Nke a pụtara na ya bụ iwu ha tiri maka apụghị ezi eruola ebe niile na mba ahụ. Ebugharịala 2020 Olympics N'egwuregwu e, emechaala bufe oge a ga-N'Afrịka eme egwuregwu Tokyo Olympics site n'ọnwa Julaị afọ ruo afọ ọzọ. Onyeisiala mba Japan bụ Shinzo Abe kwuru nke taa. Cheta na ogbochi mgbasa coronavirus dị gị n'aka, kwọọ ya mgbe dum. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị Ihe ga-agwọ coronavirus nwereike bụrụ nwa mpe mpe ihe - Mbaka" egwuregwu-49460155,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49460155,Liverpool vs Arsenal: A gwọọla Arsenal ka abacha e tinyere ose Nsukka,Mmeri a Liverpool ji ọkpụ goolu atọ asatara otu meriri Arsenal bụ nke a na-akpo 'O tiri nwata ihe n'ihu nne ya'.,"Liverpoola malitere iti Arsenal mmọnwụ na nkeji 41, mgbe Joel Matip nyeere ha goolu. Dịka nke a gachara, Mohamed Salah ji penariti deba aha ya n'ime akwụkwọ ndị nyere goolu na 49, iji mee ya nke abụọ ndị Liverpool. N'ime ọkara nke mbụ asọmpi a, a ga-asị na Arsenal enweteghi onwe ha, dịka Liverpool kechiri ha tọgbọọ. Na nkeji 58 dị n'ime ọkara abụọ, Mohamed Salah gosiri Arsenal na ""onye a na-akpọ aha, nwere nke ọ na-eme"" site n'inye goolu ọzọ. Arsenal nwara ike ma nyeta otu goolu nkasị obi na nkeji 85 nke si n'aka Lucas Torreira nke mere ya ọkpụ goolu atọ asatara otu. Agbanyeghi na e meriri Arsenal, n'ikpeazụ Nicolas Pepe woro Virgil van Dijk mpio nke mere ya mbụ n'ime asọmpi 50 ọ gbarala na Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48896152,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48896152,Nigeria vs Cameroon: Naijiria egosila kameroon na Surugede abụghị egwu ụmụaka,Super Eagles nke Naịjirịa ezila ndị Indomitable Lions nke Kameroon ihe ọkụ ji ntị oke e me site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi Iko Afrịca.,"Kameroon gbara mbọ ha niile mana Naịjirịa kwechiri ka ajọ ọnwụ rue mgbe asọmpi a gwụrụ. N'ime nkeji 20 Odion Ighalo nke Naịjirịa wụnyere otu ọkpụ goolu iji sị ndị Kameroon 'unu abịala?' Agbanyeghi nke a, Kameroon na-akwanye Naịjirịa ọkụ n'ike nke mere ha ji saa goolu a site na goolu Stephane Bahoken nyere na nkeji 41. N'ime nkeji atọ nke a mechara, Kameroon sụnyere ọkpụ goolu ọzọ site n'aka Clinton N'Jie na nkeji 44. N'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a, Kameroon malitekwara ịcha Naịjirịa ọkụ di egwu dịka ha ka jiri bọọlụ n'ụkwụ karịa Naịjirịa. Eric Maxim Choupo-Moting nke Cameroon na Wilfred Ndidi nke Naijiria N'ime nke 64 Naịjirịa biliri n'ụra site na goolu Odion Ighalo nyere nke mere ya ọkpụ abụọ abụọ. N'erughi nkeji atọ, Naịjirịa mezuru ọkpụ atọ ha site n'aka Alex Iwuobi na nkeji 66. Naịjirịa etozuo oke n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi Total AFCON 2019. Onyeisiala Muhammadu Buhari e keelala ndị Super Eagle na mmeri ha meriri Kameroon. N'otu aka ahụ Atiku Abubakar kelekwara ha:" afirika-46248226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46248226,Parenting: Ihe isii ndị nne Nigeria ji bụrụ 'ọpụrụiche',"Onye ọbụla ị jụrụ ajụjụ maka nne ya ga-agwa gị na ọ bụ nne nke ya kacha mma, mana kedụ ihe ndị mere ndị nne Naịjirịa ji pụọ iche na ndị ọzọ?","Na Naịjirịa, ndị nne nwere akparamagwa dị iche na-ewezuga ha na ndị nne ndị mba ọzọ. Ọmụmatụ akparamagwa ndị a na-esite n'okwu ọnụ ha, etu ha si eme ma ha nwee ọbịa, etu ha si azụ nwa, etu ha si elekọta ezinaụlọ wdgz. BBC Igbo chọrọ ịgba ""ọpụrụiche"" ndị nne Naịjirịa n'anwụ n'ụzọ ị na-atụwaghị anya: Etu ndị nne si pụọ iche 1) Ọmụrụ nwa eri nri: Onye ọbụla ma na enweghị ihe karịrị ịhụnanya nne na-enwe ebe nwa ya nọ, mana ọ bụghị oge niile ka ịhụnanya ahụ na-eru na nri. Ọtụtụ oge ka nne na-enye nwa ya ihe niile ọ chọrọ tụmadi nri ịhụ na o rijuru afọ, mana kedụkwanụ maka oge ndị ahụ ọ ga-amara ụma zie gị ozi ga-akpọpụ gị ebe ọ nọ eri nri? Mgbe ọ ga-abụ tupu ị gachaa bata ọ bụrụ na o richaala ihe ahụ? 2) Mkpịsị azịza: Welie aka gị elu ma ọ bụrụ na nne gị ji azịza zụtara gị akpụkpọụkwụ. Kama ndị nne ga-akpọro gị gaa ahịa, ha ejiri mkpịsị azịza agbajiri agbaji mata etu ụkwụ gị ha. Ebe o si kacha mma bụ na akpụkpọụkwụ ahụ ha na-eji mkpịsị azịza ahụ azụta na-abụrịrị ka ụkwụ gị ha. 3) Iketa 'ngwugwu': Ndị nne Naịjirịa enwere ike ịga emume na-ewelataghị ngwugwu si ebe ahụ; ọ bụ anụ, azụ tụmadụ iji akwụkwọ keta osikapa? Mara na enweghị ihe e kere ebe ahụ maọbụ na a tudoro ha egbe n'isi ka ha ghara ikere ihe. Ihe ọzọ ha ma eme ọfụma bụ ịzụta ""ihe ahịa"". 4) Ego: Ọ bụrụ na nne gị anapụghị gị ego mmadụ nyere gị oge ị bụ nwantakịrị gwa gị ka o jidere gị ya, ị gaghị enyo ma ọ bụkwa nne gị? Ọtụtụ oge ị gaghachị ka ị jụọ ese ego gị, ọ bụrụ na ego gị adaala mmiri. Kama ọ ga-enyeghachị gị ego ahụ, ọ ga-ebido gbawa gị ụgwọ ego niile o tinyere n'isi gị bido n'oge ị bụ nwata ruo ebe ị ha mgbe ahụ. Ọ ga-echetakwara gị etu o si buru gị n'afọ ọnwa itoolu, ma etu o si taa ahụhụ ka ọ na-amụpụta gị. 5) Ikpuchi mmehie: Ugboro ole ka nne gị gbochiri ntaramahụhụ nna gị gaara enye gị maka ihe ọjọọ ị mere? Ị chetakwara mgbe ndị ọ ga-agwa gị gaa laba ụra tupu nna gị anwụchie gị; ka ị nwee ike gbalahụ ụtalị a ga-apịa gị? Makana ọ ma na iwe foro chi agbala ọla. 6) Aka ntị: Nne gị ọ gbara gị aka ntị maọbụ tie gị ihe ma mecha rịọ gị biko? N'ụwa nke a? Ndị nne Naịjirịa agaghị arịọ gị biko ma ha tie gị ihe, mana ha nwere etu ha na-eji aghụghọ arịọ mgbaghara nke ha. Ndị nne mee gị ihe ọjọọ, emechaa ha nwere ike nye nri ka nke ụmụnne gị ndị ọzọ kwuo ""mana ọkwa ị ma na ị na-enye nsogbu?"", ""Ị rijukwara afọ ka ị chọrọ irikwu?"", ""gaa zụtara m ihe ntagharị ọnụ"" (nke ọ ga-abụ na ị zụtachaa ya, o nyetu gị nke ị ga-eji chefuo ihe o mere gị). Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45570484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45570484,NFF Election: Amaju Pinnick ga-achịkwa ọzọ,Amaju Pinnick emeriela na ntuliaka ndụ NFF mere taa na Katsina.,"Ọ ga-ejikwa oche ya dịka onyeisi otu ahụ. NFF kwuru na Pinnick nwetara vootu 34 ebe ndị ọzọ bụ Maigara, nwetara vootu 8 ebe Ogunjobi nwetara vootu abụọ ma Okoye enwetaghị vootu ọbụla. End of Twitter post, 1 Ndị sonyere na ntuliaka ahụ gụnyere mmadụ 44 nke ndị otu ogbu pịpịrọ na ndị nkuzi bọọlụ sonyere na ya. Onye nnọchite anya ndị Fifa bụ Luca Piazza na onye nnọchiteanya ndị otu CAF bụ Solomon Mudege bụ ndị si mba ofesi nyochara ntuliaka ahụ. Ndị na-azọ ya bụ ọkwa bụ 1. Amaju Pinnick: Onyeisi otu NFF kamgbe afọ 2014. O ji vootu 32 merie n'ime vootu 44 a tụrụ n'agba nke abụọ ntuliaka afọ ahụ. Chris Giwa chọrọ ịnara ya ọkwa ahụ n'afọ a dịka ndị ụlọikpe weghachiri ya dịka onyeisi mana Fifa kwuru na ọ bụ naanị Pinnick ka ha ma. Pinnick bụkwa osote onyeisi mbụ nke otu CAF si Naịjirịa, o nwetara ọkwa ahụ n'afọ a bụ 2018. 2. Aminu Maigari: Maigari chịrị otu NFF otu agba malite n'afọ 2010 rue 2014 mana a chụrụ ya maka okwu gbasara mmebi ego na achịtaghị nke ọma. Mmadụ asatọ n'ime mmadụ iri na atọ ndị isi otu NFF binyere aka n'akụwkọ e jiri chutuo ya n'afọ 2014. Maigarị bụbụ onyeisi oche otu na-ahụ maka ndụ na-agba bọọlụ na Bauchi steeti dị afọ 17 gbadaba. 3. Taiwo Ogunjobi: Ogunjobi bụbụ onyeisi ma kuzikwara otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Shooting Stars nke Ibadan. Ọ bụbụkwa odeakwụkwọ nke otu NFF malite n'afọ 2002 rue 2005 ma bụrụka onye otu ime obi NFF malite n'afọ 2006 rue afọ 2010. Ugbua, ọ bụ onyeisi otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Ọsụn steeti. 4. Chinedu Okoye: Okoye bụ onye na-elekọa otu egwu bọọlụ na-etolite etolite bụ Bimo FC. Ndị a bụ mmadụ anọ ndị na-azọ ọkwa onyeisi NFF ga-achị afọ anọ na-abịa. Echi ka a ga-ama mbe nabọ nke bụ oke. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48652547,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48652547,Adegoke Adewuyi: Ụkọchụkwu a na-enyocha maka ịtọrọ onwe ya ebola ya ekwensu,Ihe pụtara ọhụrụ maka akụkọ ụkọchukwu a tọrọ onwe ya bụ na o boola ya ekwensu nọrọ onwe ya.,"Mgbe akụkọ Adegoke Adewuyi bụ ụkọchukwu n'Ekiti steetị maka etu o si tọrọ onwe ya pụtachara, ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya. Ndị uweojii nọ na steeti ahụ kwuru na Adewuyi nọ n'ụlọ oriri na nkwarị abalị atọ ma zitere ndị ụlọụka ya ozi ụjọ n'ekwenti na-atọrọ ya. Asuquo Amba bụ onyeisi ndị uweojii n'Ekiti kwuru na onye ya na Adewuyi so wee mee mpụ a jikwa otu ekwenti ahụ wee zitere ndị ụlọụka ụkọchukwu ahụ na ọ bụ ego ruru nde naira atọ ka ndị tọrọ ya na-ana ka ha wee gbahapụ ya. Onye ọ bụ ọrụ ya ịdọrọ ego n'ụlọụka ahụ bụ Oyedeji Olajubu boro Adewuyi ebubo na ọ na-eje ewere mbinye adịgboroja ezupu ego n'ọba ụlọụka ahụ dị n'Ekiti state. Amba kwuru na ya na ndị otu ya anwụchiela Adewuyi na onye otu ya. Onyeisi ndị Christian Association of Naịjirịa bụ ụkọchukwu Joshua Orikogbe akatọla agwa a ma na-ekwu na ọ bụghị ihe ziri ezi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44721208,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44721208,Anyị chọrọ ikpenkwụmọtọ - Ezinaụlọ 'Corper' uweojii gbagburu,Ezinaụlọ Igwetu Linda bụ nwata ahụ na-efe ala Naịjirịa ndị uweojii gbagburu taa n'Abuja ekwuola na ha achọrọ ikpe ziri ezi gbasara ya bụ okwu.,"Ndị uweojii gbagburu Igwetu,nwata na-efe ala nna ya n'Abuja Nwanne ya bụ Amara Igwetu gwara BBC Igbo na ha anabataghị ihe ndị uweojii kwuru. Akụkọ kwuru na onye uweojii gbagburu Igwetu n'Abuja ụnyaahụ bụ Wenezde, otu abalị tupu o soro ibe ya yịpụ uwe ""corper"" tata. Ndị omeiwu ukwu nke Naịjirịa ekwekọrịtala na ha ga-etinye anya mee nchọpụta maka ihe butere ọnwụ nwaada Linda Angela Igwetu, bụ onye ""corper"" na-arụrụ Naịjirịa ọrụ n'Abuja. Omeiwu Atai Aidoko, tinyere ọnụ n'okwu a site na usoro 42 na 52 nke iwu ji ndi ụlọomeiwu Naijirịa, were sị na ọ bụ mgbe nwaada na ndị enyi ya na-ala be ya ka a gbara ya egbe, nke mere e jiri buru ya gawa ụlọọgwụ Garki. Ndị omeiwu kwekọrịtara na ha ga-enye ngalaba ha na-ahu maka egwuregwu na ndị ntoroọbịa ikike ka ha nyocha ọnwụ nwaada, ma nyekwa ngalaba ha na-ahụ maka ahụike ka ha nyocha ihe mere e jighị nye nwaada ọgwụgwọ mgbe e bu ya ga ụlọọgwụ. Ha gakwara n'ihu gwa ngalaba na-ahụ maka uweojii ka ha ga chọpụta etu ihe a siri mee. Ngalaba atọ a nwere izuụka atọ ka ha wepụta ozi nchọpụta ha. Onyeisi ndị ụlọ omeiwu bụ Bukola Saraki sị: ""Okwu abụọ dị ebe. Otu bụ ihe mere ihe jiri me? Kedu etu onye uweojii ga-eji mehie maọbụ gbaa egbe etu ọ ga-eji bute onwu nwaada a? ""Nke abụọ bụ na anyị binyere aka n'iwu nke ga-ahụ na onye ọbụla bụ mmerụ ahụ mgbọ ga-anata ọgwụgwọ, nke onyeisiala binyekwere aka na ụbọchị 30 nke Disemba, mana akwọ nwa agbọghọ ga ụlọọgwụ mana ha enyeghi ya ọgwụgwo. Ya bụru na ha nyere ya ọgwụgwọ, ọgaghị agba ọbara ma nwụọ. Anyị ga-ebido ijide ndị mmadụ maka udiri ihe a mere, makana ha agaghi akwụsị. ""Ka anyi binyere aka n'iwu a, onyeisi ala binye aka, ọ bụzị iwu. Ndị omeiwu mechara jiri otu nkeji were kwanyere nwaada a ugwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 48096871,https://www.bbc.com/igbo/48096871,"Amnesty International: Ndịagha, ndịọrụ mkpọrọ na-emetọ ụmụnwaanyị na ụmụaka n'ụlọmkpọrọ Naijiria",Ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịrị onye na mba ụwa bụ Amnesty International etiela mkpụ maka mmetọ a na-emetọ ụmụaka na ụmụnwaanyị nọ n'ụlọmkpọrọ.,"N'ozi ọhụrụ ha wepụtara ụbọchị Monde na websaitị ha, Amnesty na-agbado ụkwụ na nchọpụta ha mere na ụlọmkpọrọ dị na Maiduguri, isiobodo Borno steeti nke gosiri na a na-emetọọ ọtụtụ ụmụaka nakwa ụmụnwaanyị. Ha boro ebubo na ndị ọrụ ụlọmkpọrọ nakwa ndị a tụnyere na mkpọrọ na-emetọ ụmụaka bụ ndị etinyekọtara ha na ndị okenye ọnụ. Amnesty na-ekwu na ngụkọ ha nwetara sitere n'akwụkwọ si n'ụlọikpe na-egosi na opekata mpe ụmụaka dị 68 bụ ndị e jichiri n'ụlọmkpọrọ dị na Maiduguri n'ụzọ megidere iwu. Amnesty na-ekwu na ụmụaka ndị a bụ ndị a akpochiburu na Giwa Barrack tupu a tụnye ha nụlọmkpoọro n'agbata afọ 2016 na 2017. N'aka nke ọzọ, Amnesty International na-ebo ebubo na ndịagha Naijiria wakporo ụmụnwaanyị ndị a kpochiri na Giwa Barrack. Ha kọwara na ụmụnwaanyị atọ a nwụchiburu n'ebe ahụ gbara ha ama ma rụọ ndịagha ụmụnwoke iri aka n'ebubo ahụ. Ise n'ime ndị ụmụnwaanyị ahụ rụrụ aka n'ebubo bụ ndị na-arụ n'ụlọọgwụ dị na mkpọrọ ahụ dị na Giwa Barracks. Onyeisi Amnesty International na Naijiria bụ Osai Ojigho kwuru na ebubo ọhụrụ ndị a bụ ihe na-emebu n'ụlọmkpọrọ Naijiria Ojigho kpọrọ oku ka onyeisi Ala Muhammadu Buhari lebanye anya na nsogbu a. ""Gọọmenti Naijiria kwesịrị ịgba mbọ kpọpụta ụmụaka niile nọ na mkpọrọ na Maiduguri kpọga ha ebe e mebere maka ụmụaka ma tọhapụ ndị enweghị ihe doro anya ha mere."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44176695,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44176695,Akụkọ kachasị taa: Okonjo-Iweala 'A gaghị m emechi ọnụ maka mpụ',Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a: Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola obi ya mbanyere mpụ,"Onye bubụ mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola na ọ gaghị emechi ọnụ n'ibu agha megide mpụ N'ajụjụ ọnụ ndị BBC Focus on Afrịka gbara ya, Ngozi na ọ bụ ibu agha a mere eji tọọrọ nne ya n'afọ 2012. Ụlọikpe Suprim atọhapụla onye so n'akụkọ Otokoto Ka afọ iri abụọ na abụọ gachara, ụlọikpe Suprim atọhapụla Alban Ajaegbu so na ndị ekwuru gburu otu nwata n'owerri. Cheta na Otokoto na ndị otu ya ọzọ gburu Ikechukwu okoronkwo n'afọ 1996. Akụkọ ofesi Ihe ruru mmadụ iri anwụọla dịka a gbara egbe n'otu ụlọakwụkwọ dị na Houston Texas ndị uweojii kwuru na ndị a nwụrụ karịrị n'ụmụakwụkwọ, ebe anwụchiela otu nwata akwụkwọ n'ihi nke a. N'Egwuregwu Ndị Super Eagles na otu Atletico madrid ga-agba asọmpị enyi na eny n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee a. Nke a ga-adị n'ọgbọ egwuregwu Gods Will Akpabio dị n'Uyo, iji jikere ndị Super Eagles n'asọmpị iko mba ụwa. Gee ya nkeji nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Gịnị bụ carpet n'asụsụ Igbo?" afirika-45539130,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45539130,Kedụ ebe Kemi Adeosun nọ ugbua?,Akụkọ na-arị ibe ya elu ugbua na-ekwu na Kemi Adeosun bụbu Minista na-ahụ maka ego ahapụla obodo Naịjirịa.,"Kemi Adeosun kwuru na o chere na asambodo ya bụ ndị ezigbo ya Ndị maara minista a nke ọma gwara ndị ọrụ akwụkwọ ntaakụkọ 'Premium Times na Guardian' na minista ahụ laghachiri mba Ịngland bụ ebe o si bịa malite ọrụ na Naịjirịa. O kwuru na ""Ụnyaahụ mgbe Adeosun gbarachara arụkwaghịm, onyeisiala Buhari na-abatara akwụkwọ ya, na ọ rụrụ ọrụ rue n'ime abalị. Dịka o mechara nke a, o were ngwaọrụ ya nye odeakwụkwọ ministri na-ahụ maka ego bụ Isa Momoud Dutse ma lawa n'ụlọ ya. N'ime awa ole na ole, ndị ọrụ nchekwa ya bịara buru ya gawa ọdọugbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja bụ ebe ọ bara ụgbọelu hapụrụ Naịjirịa."" E duru Kemi Adeosun iyi ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego n'afọ 2015 Mana onweghi ndị enyemaka ya kwere ekwu ma nke ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. Cheta na Kemi Adeosun gbara arụkwaghịm n'ihi ebubo na asambodo NYSC o ji arụ ọrụ bụ nke adịgboroja. Tupu akụkọ na ọ hapụla Naịjirịa apụta , pati PDP kwuru site n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ha na gọomenti etiti ezopụla Adeosun i ji mee ka ọ gbanarị ntaramahụhụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43376171,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43376171,Ego ole ka ndị ụlọikpe na-eri?,Onye sinetọ na-anọchite ndị Kaduna Sentraal bụ Shehu Sani ekwupụtala na a na-akwụ ha ihe ruru ego nde naịra 13.5 kwa ọnwa ha ji arụ ọrụ.,"Shehu Sani na-anọchi ndị Kaduna na sineti Mana Sani kwuru na ego ahụ agunyeghị puku narị naịra asaa bụ ụgwọ ọnwa a na-akwụ ha. O kwuru na a kpọghị ego ahụ aha mana e nyere ha iwu iweta akwụkwọ ego ọbụla ha mefuru si n'ọnụ ego nde naịra 13.5 ahụ. Nke a ebutela akụkọ n'akụkụ dị iche iche dịka ndị mmadụ na-ekwu na ego ahụ karịrị akarị. Otu sinetọ Naịjirịa na-erite ihe ruru nde 156 kwa afọ. Ọ bụrụ na ị na-erite ụgwọọnwa ọpekata mpe (₦18,000): Ọ bụrụ na ị na-erite ₦50,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦100,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦150,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦200,000: Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a kamgbe ị nọ na peeji a onye mere ya Etu e si eme ya Ihe e ji mee atụmatụ ụgwọọnwa ndị sinetọ sitere n'okwu Sinetọ Shehu Sani kwuru, bụ otu n'ime ndị sineeti Naịjirịa n'ụbọchị Maachị 7, 2018. Ego ole ndị sinetọ na-eri n'ụgwọọnwa adịghị n'ebe ọha na-ahụ ya anya ugbua. N'ụbọchị Maachị 20 2018 e jiri http://xe.com gbanwee ego n'ọnụ 1USD=359.200NGN, , 1GBP = 503.483NGN Ihe mgbakọ were ya na otu akpa osikapa ga-abụ ₦15,000 Kekọrịta peeji a Kekọrịta peeji a Ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na bekee kwuru na ego ahụ karịrị akarị, ebe ego ekewapụtara maka ndị ọrụ bụ naanị puku naịra iri na asatọ (N18,000). Fidelis Edeh bubu osote onyeisi ndị NLC kwuru na ọnọdụ a bụ ihe na-agba anya mmiri maka na ọ dịka ka ha a nọrọ onwe ha. N'okwu ya: ""Nke a o kwukwara abụghị ebe ahụ ka o bere, a na-akwụkwa ha ego iji rụọ ọrụ maka ndị ha na-anọchite. ""Mana onye ọbụla makwa na ọ bụ ha na-ahazi etu a ga-esi mee ya mana ị ga nime obodo ebe ha kwesiri ịrụ ọrụ ahụ, onweghi ihe ị ga-ahụ."" Ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu a kwuru na ndị sinetọ anaghị etinye uche na iwelite ego ụgwọ ndị ọrụ mana ọ bụ naanị onwe ha ka ha na-elegara anya. Ndị lagoro ezumike nka emela ngagharị iwe ọtụtụ oge maka ego a na-akwụbeghi ha I mara ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị Naịjirịa? Edemede a si n'aka ndị RMAFC- http://www.rmafc.gov.ng/ Ilebe anya na mpaghara mba ụwa ndị ọzọ, Naịjiria na-emefu ego n'ọchịchị karịa mba ụwa ndị ọzọ ọbụla. Ndị NLC emela njegharị iwe ọtụtụ oge maka ụdị ego a na-akwụ ndị ọrụ Otela ndị mmadụ na-ajụ ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị mana, ngosipụta sinetọ Sani ekpughele ihe ezoro ezo. Ego ole ka mba ndị ọzọ na-emefu n'ọchịchị? Edemede a si: Arabian Journal of Business and Management Review(OMAN Chapter) Vol. 4, No.5: December 2015. Nke a gosiri na Naịjiria kacha mba ndị ọzọ niile n'ụwa akwụ ndị ọchịchị ụgwọ ọnwa. Ọnọdụ a adịghịkwa ọtụtụ ndị Naịjiria mma n'obi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43205502,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43205502,Massob: Dapchi na-egosi na Gọọmenti emeribeghị Boko Haram,"Massob akatọọla ọtịtọ atọrọ ụmụakwụkwọ mmadụ otu narị na iri na ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti.","Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu nọ na-atụ anya ha Onye na ekwuchitere Massob ọnụ ha bụ Mazị Bariara Kpalap gwara ndị BBC Igbo na ebe ọ bụ na Boko Haram nwere ike ịtọrọ ụmụakwụkwọ na-eleghị anya na-azụ, o gosiri na gọọmentị akajibeghị Boko Haram nku dị ka ha si wee kwuo. Ọ kwara arịrị na ihe ọdachị dịka nke a nwere ike imekwa ọzọ n'ala anyị, ebe anyị ekutabeghị ume na nke meburu na Chibok, Borno steeti ihe karịrị afọ atọ gara aga. Massob gwara gọọmentị ka ha were ọsọ ọsọ mee ihe nile ha nwere ike ime ka ụmụaka ahụ laghachite n'aka nne na nna ha. O kwuru na ihe ga-eme ndị mmadụ enwekwa ntụkwasị obi ọzọ na ebe goomenti nọ bụ na ha na echekwaba ndụ na akụ na ụba ndị ala anyị ọfụma. Kemgbe ụbọchị ole na ole gara aga, ndị nne na nna ụmụaka ụmụnwanyị ahụ atọrọ nọ n'akwa na iru ụjụ ma na arịọ gọọmenti ka ha kpọghachite ụmụ ha na egbughị oge. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada" 44699339,https://www.bbc.com/igbo/44699339,Etu e si gbagbuo ndị uweojii asaa n'Abuja,Ndị ji egbe gbagburu ndị uweojii asaa na Galadimawa Junction nke dị nso n'ọdụụgbọelu dị n'Abuja.,"Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị Onyeisi ndị uweojii n'Abuja bụ Sadiq Bello, kwuputara nke a n'ehihie Tuusde tiri ezịnaụlọ ndị otu ha ọdachie metụtara aka n'obi ma kwee ọha mmadụ nkwa na e ezipụla ndị uweojii iji chekwa ndụ na ihe ndị mmadụ nwere n'Abụja. Akụkọ kwuru na ndị omekome ji ụgbọala wakporo ndị uweojii nọ n'okporoụzọ gara ọdụụgbọelu n'Abuja na ntụmadị gbagbua asaa ma gbafukwa ngwangwa ha mechara nke a. Dịka otu onye bi na mpaghara ebe ihe ahụ mere nke achọghị ka a kpọọ aha ya siri kọwa, ndị uweojii kwụsiri ndị ahụ iji nyocha ụgbọala mana tupu ha nwee ohere mee nke a, ha bido gbawa ha egbe, ma gbagbuo asaa n'ime ha. Onyeisi Ogige ndị uweojii Lugbe bụ CSP Tunde Kabiru kwuru n'ihe ahụ mere bụ eziokwu. O kwuru na ndị mere ihe ahụ abụghị ndị otu nzuzo dịka ọtụtụ ndị mmadụ siri chee. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Manzah Anjuguri, sịrị kwuo n'akwụkwọ ozi o wepụtara, ndị uweojii ebidola nyocha itinyela imi n'ala ma sipụta ndị mere mpụ ahụ. Mkpamkpa a na-eme abalị atọ e gbuchara ndị uweojii abụọ n'Akwa-Ibom nakwa ọnwa atọ e gbuchara ndị uweojii iri na Benue steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52559972,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52559972,Covid-19: 'Ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka m nụrụ na m bụ ọrịa coronavirus',Sita Tyasutami na nne ya Maria Darmaningsih bụ mmadụ abụọ bu ụzọ bute ọrịa coronavirus na mba Indonesia.,"Kama ihe mere ka ọnọdụ ha pụọ iche bụ etu ha siri mata na ha bu ya bụ ọrịa. Nne na nwa gara ụlọọgwụ dịka ha na-egosi njirimara ọria coronavirus ma na-eche ka agwa ha mpụta nnyocha emere ha. Kama ọ bụ mgbe ha na-ele ihe onyonyo oge Onyeisiala Indonesia bụ Joko Widodo na-agwa ndị mba ahụ okwu ka ha matara na ha bu ọrịa coronavirus. Onyeisiala Widodo kwuru na mgbasa ozi ya were sị na Indonesia enwetela mmadụ abụọ mbụ bu ọrịa coronavirus. Widod kpọrọ afọ ole ndị ahụ dị, ụlọ ọgwụ ha nọ na ndị ha na ha nwere mmekọ. Akpataoyi wụrụ Tyasutami n'ahụ dịka ọ chọpụtara na ọ bụ ya na nne ya ka onyeisiala na-ekwu maka ya. Tyasutami gara ụlọọgwụ kama o bughị coronavirus n'obi O wutere ya na ọ bụ n'ihe onyonyo, site n'ọnụ onyeisiala ha ka ha ga-eji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Etu osiri bido Mgbe olu bidoro ịkọ Sita ọkọ, o nweghị ihe ọ kpọrọ ya tupu ya eruo ụtụtụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Febuwarị mgbe ahụ ya biara mesiwa ya ike. Nne ya bụ Darmaningsih na-arụ ọrụ dịka onye nkuzi na Mahadum ndị na-agba egwu dị na Jarkarta, dakawra ọrịa ma ha abụo amaghị ihe na-eme ha. Ha gara ụlọọgwụ ebe dọkinta gwara Tyasutami na ọ nwere ọrịa ""Typhus"" ebe nne ya nwere ""Broncopneumonia"". Edopụrụ ha abụọ iche n'ụlọọgwụ maka ndị bu nje Ha gwara ndị ụlọọgwụ ka ha mee ha nnyocha maka coronavirus kama ndị ụlọọgwụ jụrụ n'ihi na ha enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha. Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febuarị mgbe otu enyi Tyasutami gbara ya ama na ya bụ Tyasutami gara otu ọgbakọ ndị egwu ebe otu nwaanyị si mba Japan bụ ọria coronavirus biakwara. Mgbe ahụ ka Tyasutami matara na agwọ nọ n'akịrịka. Tyasutami kwuru sị ""ugbua ka m siri ọnwụ were gwa dọkinta ka ha nnyochaa anyị maka coronavirus"". Dọkịnta kwetara ugbua ma edopụkwara ha iche n'ụlọọgwụ pụrụiche maka ndị bu nje. Ọ tụrụ Tyasutami na nne ya Darmaningish n'anya na ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka ha ji mara na ha bu ọrịa coronavirus. Ọ bụ mgbe abalị abụọ gara ka a gwara Tyasutami na Darmaningish na iwu obodo Indonesia nke ehiwere n'afọ 2009 na-ekwu na mgbe ọbụla e nwere ọrịa zuru ụwa ọnụ, na ọ bụ onyeisiala ka a ga-ebu ụzọ gwa. Kama ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba Indonesia bụ Achmad Yurianto gwara BBC na ọ bụ etu a ka iwu ha dị. N'aka nke ọzọ nwanne Tyasutami bụ Ratri Anindyajati kwuru sị "" ndị mmadu na-ata nwanne m ụta na ọ bụ ya butere ọrịa a na mba anyị, ọtụtụ na-ata kwa ya ụta na ọ bụ ya mere e jiri chụọ ha n'ọrụ"". Dịka onyeisiala kwuchara okwu ya, mkpọbịrị aha Tyasutami na nne ya, akara ụlọ ha ma ihe gbasara ahụike ha jupụtara na ""Whatsapp"". Tyasutami kwuru sị ""tupu m bute ọrịa coronavirus, enweghị onye na-agwa m okwu ọjụọ, mmadụ puku abụọ na-eso m n'Instagram ma ugbu a ha eruola mmadụ puku iri. Ndị mmadụ na-ekwu zi okwu na ihe onyonyo ebe m yi mbeleukwu m ji agba egwu"" Sita tyasutami bụ onye ọgba egwu Ratri Anindyajati bidoro igosi njirimara ọrịa coronavirus nke mere ka ọ gaa kwa nnyocha. Mpụta nnyocha ya gosikwara na o butela ya bụ ọrịa Ihe mere ịkpọ mmadụ ""Patient Zero"" ji dị njọ Ntule Richard Mckay bụ Ọkammụta na onyenkụzị ihe gbasara mbido ọrịa zuru ụwa ọnụ Mckay kọwara na ịkpọ mmadụ ""Patient Zero"" maọbụ onye mbụ bu ụzọ bute ọrịa zuru ụwa ọnụ na-eduhe karị ndị mmadụ. O kwuru na a na-enwekarị ndị ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọ gaghị egosi n'ahụ ha. Mckay kọwara na-ịkpọ mmadụ onye mbụ butere ọrịa dịka coronavirus na ebute kwa ịkpa oke na ịkwa emu. Ọ kọwa kwara na ọtụtụ mgbe, gọọmentị agaghị etinye ụchụ ị chọpụta ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa a dika ha ga-etinye uche ha niile na ndị mbụ ha chọpụtara maọbụ ndị a na-akpọ ""Patient Zero"". Sita Tyasutami na ndị Ezinụlọ ya enwerela onwe ha Dịka ọ dị ugbua, Tyasutami, Anindyajati na nne ha bụ Darmaningish enwerela onwe ha. Ụfọdụ na-akọ ha ọnụ, akpọ ha ekwensu kama Anindyajati sị "" anyị kwetere na enwere ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa ma ewepụ anyị, kama ma enweghị ihe ọzọ, nchọpụta nke anyi mere ka gọọmentị bido iluso coronavirus ọgụ"". Ụgbụ a,mba Indonesia enwela mmadụ puku iri na abụọ bu ọrịa coronavirus ebe mmadụ narị itolu anwụọla site n'aka ya bụ ọrịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44458540,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44458540,Ikpe: Innoson ekwetala na ha duhiere ọha,Ụlọọrụ Innoson ekwupụtala na ha duhiere ọha n'ozi ha wepụtara ebe ha kwuru n'ụlọikpe kachasị kpebiri ka GTbank kwụọ ha ijeri naira iri na anọ (N14bn).,"Onye ọkaịkpe ji okwu ekwuola na ọ wepụla aka ya n'ihe gbasara okwu a N'akwụkwọ ozi Innoson wepụtara n'abalị asaa nke ọnwa Juun n'afọ 2018, ha kwupụtakwara na ụlọikpe nyere GTbank iwu ka ha kwụọ ha ego ahụ tupu izuụka abụọ aga. Mana n'abalị iri na otu nke ọnwa Juun afọ a, Innoson kwugharịrị n'igwe okwu Twitter ha sị na ha kọwahiere mkpebi ụlọikpe ma duhiere ọha n'okwu ha na GTbank. End of Twitter post, 1 Cheta na, na nzaghachi nke GTbank nyeburu, ha kwuru n'ozi ha wepụtara nke odee akwụkwọ ụlọakụ ahụ bụ Erhi Obebeduo tinyere aka ya na ihe Innoson kwuru abụghị ihe mere eme. Ọ sịrị: ""Anya anyị eruola akụkọ na-efegharị na soshal midia nke kwuru ụlọikpe kacha na Naijiria nyere anyị iwu ka anyị kwụọ onye ọbụla iji anyị ụgwọ. ""Nke a bụ iji gwa ndị na-etinye ego n'ụlọakụ anyị na ọha ka ha ghara iji okwu ahụ na-efegharị nke kwuru na ụlọikpe kachasị nyere anyị iwu ịkwụ onye ọbụla anyị na ya na-emekọ ihe ụgwọ ọbụla. ""Ụlọikpe kachasị ekwughị ihe ọbụla banyere anyị ịkwụ onye ọbụla ego ọbụla. Ọzọkwa bụ na adịghị eziokwu dị n'ime akụkọ ndị mmadụ na-ekwu gbasara okwu a mana ọha legharịa ụdị okwu a n'uju."" GTbank: Ụlọikpe kachachị ekwughị ihe ọbụla banyere anyị ikwụ onye ọbụla ego ọbụla Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: ""Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1""" 44960851,https://www.bbc.com/igbo/44960851,Nwoke egbuola nne ya maka okwu ala,"Otu nwoke gbara afọ 42 aha ya bụ Chiedu Ikegwuonwu, onye Uruagu Nnewi dị na Anambara steeti ji mma gbuo nne ya ụnyaahụ ka ya na ya nwesịrị esemokwu maka ala nwanne ya nke ọ tọrọ.","Akụkọ kwuru na Chinedu ji mma gakwuru nne ya bụ Benedict nwechara ebe ọ na-esi nri si na azụ gbupụ ya isi, ma hapụkwa ụmụ ya na nwunye ya gbafuo. A na-ebo ebubo na ihe na-ese bụ alaobi nwanne ya ọ tọrọ nke Chiedu chọrọ ị nara ya ma nne ya akwadoghị ya. Na mkparịtaụka onyentaakụkọ BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambara steeti bụ Haruna Mohammed nwere n'ekwenti, o kwuru na ihe a mere n'ezie mana o kwuru na odobeghị ha anya ihe mere nwoke ahụ jiri gbuo nne ya. Ọ gara n'ihu kwuo na adonyela nwaanyị ahụ n'ụlọozu maka ime nyocha, ebe ha ka na-achọ nwoke mere ihe a bụ onye gbarala ọsọ. Harụna sịrị: ""O bụ ezie. mana anyị amatabeghị ihe mere o jiri gbuo nne ya. ""E wetara anyị ozi na Chiedu Ikegwuonu dị afọ 42 ji mma wakpo nne ya bụ Benedeth Ikegwuonu dị afọ 67 gbuo ya mma n'olu na akpịrị. ""Ndị uweojji si ogige Sentraalụ Police Station gbagara ebe ihe a mere ma buga onye ihe mere ụlọọgwụ Akwudo ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla. ""Ka ọ dị ugbua, anyị adonyela ozu ya n'ụlọ ozu maka nyocha. Anyị na-agbakwa mbọ ịnwụchị nwa amadị ahụ gbarala ọsọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52570104,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52570104,Orji Uzor Kalu: Ụlọikpe kachasị akụchapụla ikpe a mara ya maka nrụrụaka,Aka chịburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu ga-esi n'ụlọ mkpọrọ pụta.,"Orji Uzor Kalu ji ọkwa 'chief whip' n'ụlọ omeiwu ukwu tupu a tụọ ya mkpọrọ Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị kụchapụrụ ikpe a mara ya maka nrụrụaka. Cheta na ụlọikpe dị na Legọs mara Kalu ikpe ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ maka izu ego Abia steeti oge ọ bụ gọvanọ. Ọ bụ n'ọnwa Disemba afọ 2019 ka e kpere ikpe a. Oge nke a mechara, Kalu gbagharịrị akwụkwọ n'ụlọikpe mkpesa, mana ụlọikpe ahụ kwuru na mkpọrọ a tụrụ ya ziri ezi. Nke a mere ka Kalu were ikpe ahụ gaa ụlọikpe kachasị. Oge e du Orji Uzor Kalu aga ụlọ mkpọrọ Ụlọikpe kachasị kwuru na ọkaikpe ahụ kpebiri ikpe Kalu abụghị onye kwesịrị ikpe ya bụ ikpe. Ọkaikpe 'Supreme Court' aha ya bụ Olabode Rhodes-Vivour kọwara na Mohammed Idris abụghịzị ọkaikpe n'ụlọikpe ahụ oge ọ mara Kalụ ikpe. E buliri Mohammed Idris n'ọkwa gaa ụlọikpe 'Appeal Court' mana ọ natara ikike ka ọ nọrọ kpechaa ikpe Orji Uzor Kalu tupu ọ pụọ. Dịka ndị ọkaikpe 'Supreme Court' si kọwaa, ikike ahụ Idris natara ezighi ezi n'iwu Naịjirịa nke a mere na ikpe ọ mara Kalu agaghị akwụdo. Mana ụlọọrụ EFCC bụ ndị kpụpụrụ ya n'ụlọikpe sị na ikpe a bụ kpagbu megide agha mpụ maka na ihe akaebe ha ji n'ebe Kalu nọ buru ibu. Ha sị n'ebubo e boro ya kadị n'ụlọikpe akachapụghị ha, na ha ga-agakwa ịmalite ikpe ya ọzọ. Nwoke ọ pịara nwata nwaanyị a mụụrụ ya n'ala? Ndị uweojii nọ n'Imo steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị n'elu soshal midia na otu nwoke akpọrọ Ezekiel Anorue piara nwa nwaanyị amụrụ ya ọhụrụ n'ala bụ asị. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikeokwu Godson kwuru na onweghị mgbe ihe dị etu ahụ mere. Godson kwuru na onweghị mgbe ya ji kwuoro ndị ntaakụkọ gbasara ya bụ ihe dịka akụkọ ụgha ahụ si kwuo. Ọ rịọkwara ka ndị na-ede udiri akụkọ ụgha chegharịa maka ibutere obodo ọdachị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47645784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47645784,Abia state: Anyị akwapịaghị ụlọ oriri ndị ahụ maka akwụnakwụna,Gọọmentị Abia steeti akọwarala BBC Igbo ihe mere ha jiri gbachie ụfọdụ ụlọ oriro n'Aba.,"Okaiwu Ikpeazu gwara BBC Igbo na ọ bụghị maka ụmụnwaanyị na-agba akwụnwa ebe ahụ butere mgbachi ahụ. Ha kọwara na ọ bụ maka na ebe ahụ aghọrọla ụlọ ebe ndị ohi na-ezukọ onwe ha ma na-akpa mkpamkpa. N'ọnụ ya ""nchekwa ndụ na akaụnaụba ndị mmadụ bụ ihe dị gọmentị Abia steeti mkpa."" O kwukwara na o teela aka ha na-anụ akụkọ gbasara mwakpo ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ na-agafe n'akụkụ ebe ahụ. Ugbua a na-akwado ịkwapịa ụfọdụ ụlọ ndị ebe Ikpeazu kwuru na ""a ga-etinye osisi ọkụ latrịk n'okproụzọ ebe ahụ'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49705853,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705853,Rochas Okorocha: 'Ipob biko kọwara anyị ebe ụnụ kwụ ka anyị sonyere ụnụ',"Gọvanọ chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụrụ na ndị Igbo ga-enwe ọche onyeisiala n'afọ 2023, ọ ga-doriri ndị ugwu anya.","Ọ rịọrọ ka ndị ntaakụkọ kwụsị ịkpọ ya oche onyeisala ndị Igbo makana o nweghị agbụrụ ọbụla edowere ya iche. Okorocha kwuru nke a mgbe ọ na-asa ajụjụ ọnụ ndị ntakụkọ ụlọọrụ mgbasaozi 'SUN' gbara ya nso nso a. Okorocha jụkwara kedụ uru Ipob ga-erite maọbụrụ na ndị Igbo kewapụ onwe ha na Naịjirịa. N'okwu ya, ""ọ bụrụ na ndị isi Ipob azanwụghị ajụjụ a, ọ ga-ahịara ndị isi otu ahụ ịchịkọta ebumnobi ha."" Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ O kwuru na ruo ugbua ọ mabeghị ebe Ipob kwụ akwụ. Gbasara okwu na-ese n'etiti ya na gọọmenti Imo steeti ugbua, Okorocha kwuru na ihe gọọmenti Ihedioha na-eme e doghi ha anya. O kwuru na ebe a na-ata ya ụta bụ na ọ naghị eke ego. Gbasara ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu, Okorocha kwuru na o nwere olileanya na ọ ka ga-achị Imo steeti. Okorocha kwuru na nyocha EFCC na-eme ya adịghị njọ makana ha nyocha, o nweghị ihe ha fụrụ, ha hapụkwa onye ahụ. Mana ọ na-rịọ ka ndị mmadụ kwụsị ịhụ ndị a na-eme nyocha dịka ekperima. Okorocha kwuru na okwu na ya napụrụ ndị mmadụ ala n'ike ha n'Imo bụ okpotokpo asị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-44387380,https://www.bbc.com/igbo/media-44387380,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọgbụnigwe egbuola ndị uweojii na kwa Russia 2018 fọrọ abali asatọ,Akụkọ kachasị n'abalị a Ọgbụnigwe agbuola ndị uweojii ala Kenya ise,Ogbunigwe agbagbuola ndị uweojii mba Kenya ise oge ụgbọala ha nya na okporoụzọ metụtara ogbunigwe na mba Somalia. Akụkọ kwukwara na mmadụ atọ ọzọ meruru ahụ. Ụlọikpe ekpeebiela na Buhari anaghị ekwupute ụgwọ ọ kwụrụ n'ụlọọgụ Ụlọikpe ukwu dị n' Abuja ekpebiela na onyeisiala Muhammadu Buhari ekwesighị igosi ọnụ ego ọ kwụrụ dịka ụgwọ ụlọọgwụ nke ọ natara n'ala Briten n'afọ gara aga. Cheta na ọ bụ otu kpọrọ onwe ha 'Advocacy for Societal Rights Advancement and Development Initiative' na bekee bụ ndị gbara Buhari akwụkwọ ahụ. Stella Oduah abaala Apga Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Stella Oduah ahapụla otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP gawa APGA. Akụkọ na-abata n'ehihie a kwuru na ọ bụ onyeisi otu APGA bụ Victor Oye bụ onye nabata Odua n' isiụlọ ọrụ a n'Abuja Emeriela otu Super Eagles ọzọ Otu egwuregwu Czech Republic ejirila otu ọkpụ na asataghị ihe merie otu Super Eagles n'asọmpị enyi na enyi ha agbara taa na mba Austria. Ọ bụ Thomas Kalas bụ onye nyere goolu a n' elekere iri abụọ ni ise na agba nke mbu. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị taa Onye ka ị chere ga-ebuli iko mba ụwa? Gụọ akụkọ ndị ọzọ afirika-48899195,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48899195,AfCFTA: Uru atụmaatụ a ga-abara Naịjiria,"Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyechara aka n'akwụkwọ maka nkwekọrịta azụmahịa na mba Africa, ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ uru ọ ga-abara ha.","Ihe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA) Lee ihe ise mbinyeaka a ga-emere Naịjirịa. 1. Ọ ga-eme ka Naịjiria na obodo ndị nọ n'Africa Union na-azụ ahịa ruru ogo pasenti iri isii (60%) karịa iri na isii ha na-azụbụ. 2. AfCFTA ga-emepụta ebe azụmahịa kachasị na mba ụwa niile. 3. Ọ ga-enye ndị na-azụ ahịa na Najirịa ohere iso mmadụ ruru ijeri abụọ zụkọta ahịa. 4.Ọ ga-enye ndị Naịjirịa sonye na akụnaụba ruru ijeri dọla abụọ nke ka akụ na ụba Naịjirịa. 5. Ụmụ Naịjirịa na-azụta ahịa ga-erite uru na ndọkọrịta ga-adị n'etiti ọtụtụ ndị azụmahịa. Onyeisiala Mohammadu Buhari gara na Niger Republic ụbọchị asaa nke ọnwa July binye aka n'akwụkwọ maka atụmatụ ""African Continental Free Trade Area""(ACFTA) ga-ahụ na mba Afrika na-azụkọta ahịa na-enweghị nsogbu. O bụghị taa ka ekwụwere okwu ya bụ atụmatụ nzụkọrịta ahịa na mba Afrika. Kedu ihe o ji dị mkpa na Naịjirịa binyere aka na ya bụ akwụkwọ? Atụmatụ mekọrịta azụmahịa nke mba Afrika kpụrụ afọ n'ala afọ gara aga mgbe Naịjrịa jụrụ na ha agaghị entinye aka na ya. Naịjrịa bụ mba kachasị na mba Afrika ma nọrọkwa n'isi ihe a na-eme na ya bụ ọgbakọ. Mgbe Naịjirịa sepụrụ aka na ya bụ ọgbakọ, ụwa che na ọgbakọ azụmahịa mba Afrika akpụọla afọ n'ala kpam kpam. Onyeisiala Buhari sị ka enye ya nwobere oge ka ya chebere ya bụ atụmatụ echiche. Kemgbe ahụ otu ehibere ilebe anya na azụmahịa Naiịjrịa akpọrọ ""Nigerian Office for Trade Negotiation"" sị na ha na otu ruru iri abụọ na asaa etikọọla isi maka ya bụ okwụ mata iri dị na ya. Uru dị na Naịjirịa ịnwete obosara ahịa na mba Afrika juru eju bara abara agbanyeghị na ọtụtụ na atụ egwu na ọrụ na ngwaahịa agaghịzị ezu ndị chọrọ ya. Ugbua Naịjirịa tinyegoro aka na-akwụkwọ nkwekọrịta a, Afrika ịwete obosara ahịa buru ibu dịka Urop adịwala nso. Ugbua Naịjrịa enweela ohere ịmekọrịta ha na mba ndị ọzọ nwere agba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50259678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259678,Lagos building collapse: Ụlọ elu adakwasịla ndị mmadụ n'Ikoyi Legọs,Ụlọ ọzọ adala n'ebe a kpọrọ Glover court dị n'Ikoyi Legọs Steeti n'ụbọchị mbụ ọnwa Epụrel 2019 ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.,"Ụlọ bụ ụlọ elu ogogo abụọ a ka na-arụ arụ dara mgbe oji nkeji iri gafee elekere anọ nke ehihie. E burula mmadụ anọ ndị achọpụtarala gawa n'ụlọọgwụ maka ị nata ọgwụgwọ ebe a ka na-agba mbọ ịzọpụta ndị ọzọ. Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs bụ LASEMA n'ịchafụ na ndị ọzọ nọ ebe ahụ ịhụ na-azọpụtara ndị mmadụ tọrọ n'ime ụlọ a. Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ a gwara BBC na ndị otu ha nọ n'okpuru ụlọ ahụ na-ehi ụra mgbe ọ dakwasịrị ha. Ọ sị na ha enweteghi ụgbọala Katapila ga-enyeaka ibọlite ụvụrụ aja ndị ahụ ọsịsọ ruo mgbe ihe dịka awa atọ gachara. N'ofesi Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Spen maka ikpe sị na ọ bụ naanị mmetọ ka ụmụnwoke ise metọrọ nwata nwaanyị dị afọ iri na anọ na ọ bụghị wakpo n'ike. A tụrụ mmadụ ise a mkpọrọ afọ iri ruo afọ iri na abụọ ebe ntaramahụhụ mwakpo n'ike bụ afọ iri na ise ruo afọ iri abụọ. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu Arsenal bụ Unai Emry sị na Granit Xhaka agaghị eso gbaa bọọlụ ha na Wolves na Satọde. Xhaka wesara ndị nkwado Arsenal iwe n'ihi ụzụ ha tụrụ ya n'isi mgbe ewepuru ya n'asọmpị ha na Crystal Palace n'izuụka gara aga. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye 'Operation Positive ID dị ka Apartheid' - Femi Falana Onyeagha na-enyocha ndị nọ n'elu ọgbatumtum Onye ọkaiwu ama ama bụ Femi Falana akpụpụla ndịagha Naijirịa ụlọikpe maka emume nyocha ha kpọrọ ""Operation Positive ID"". Falana kwuru na ndị agha chọrọ ịnapụ ndị uweojii ọrụ ha ma sị kwa na ọtụtụ ndị Naijirịa enweghị akwụkwọ njirimaraonye ha ga-ewpụta ma ajụọ ha. O kwukara na emume a bụ ụzọ ndịagha ga-eji imaja ma na-akpagbụ ndị Naijirịa Na Legọs Onye etinyere ịga n'ụkwụ Ndị uweojii na Legos azọpụtala mmadụ iri na abụọ ejikpara n'ụlọ ekpere dị na Isheri Osun. Atụrụ ụfọdụ n'ime ndị ịga kamgbe 2014 nke mere na ha enweghi ike ị ga ije. Nke a na enwete ya ụlọ ụdị a anọ achopụtara na Naịjirịa kemgbe ọnwa abụọ. A hụla ebe eji ndị mmadụ, ọkachasị ụmụaka, na Kaduna steeti nakwa otu na Katsina steeti N'Ofesi Ụlọ Donald Trump si kwapụ Ndị ọchịchị na New Yorka si Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga nke ọma dịka ọ kwapụrụ n'ụlọ ya bụ Trump kwaga Obodo Florida. Trump kwuru na nke a bụ maka ajọ agwa ndị ọchịchị New York na-akpasa ya na agbanyeghị nnụkwụ ụtụ isi ọ na-atụ. Nke a na-abịa ka ndị Ụlọ Omeiwu obele na Amerịka malitere njem ịchụtụ Trump N'ọkwa. N'Egwuregwu mgba Tyson Fury jị ọkpọ kụpụ Braun Strowman O jị ọkpọ etigbu agụ bụ Tyson Fury egosila ihe o ji bụrụ dike dịka ọ gbara mgba n'emume Crown Jewel nke ndị WWE ma merie nwokeike bụ Braun Strawman. Tyson na-akwadozi maka ọkpọ ya na Deontay Wilder ga-esu n'ọnwa Febụwarị 2020. N'Egwuregwu bọolụ Ndị Chelsea agaala ụlọikpe maka mmachị FIFA machiri ha FIFA amachiela otu egwu bọolụ Chelsea igo maọbụ ire mmadụ ruo ọnwa Janụwarị afọ 2020 maka na ha daara iwu ruru otu narị na iri ise metụtara mmadụ iri asaa na otu na-agbara ha bọọlụ. Akụko ga-amasị gị Gee Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ" afirika-43297842,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43297842,Agwọ loro ego: EFCC anwụchiela ndị ụlọọrụ Jamb,Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka nyocha mpụ na nrụrụaka bụ Efcc anwụchiela ndị a na-atụaka n'ọrụ ha bụ ibupu ego dị n'akpa Jamb site n'ụzọ n'ezighị ezi.,"Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb maka agwọ lolo ego Philomena Chieshe bụ nwaanyị kwuputara n'agwọ loro nde naira 36 n'ụlọọrụ ha na Makurdi, so na ndị Efcc gbakwara ajụjụ ọnụ gbasara ego dị n'akpa Jamb. Ndị nchọpụta gara n'ụlọọrụ ha kwuru na Chieshe kwuputara na ọ bụ onye nhazi ha bụ Samuel Umoru ka ọ nọ na-enye ego ahụ ntakịrị ntakịrị. Ka ọ na-eme nkwuputa n'aka ndị Efcc, Chieshe bụ onye odeakwụkwọ n'ụlọọrụ Jamb nke Makurdi gwara ha na Umoru na-agwakarị ya wepụtara ya ego ha retere site n'akpa ego ya dị n'ụlọakụ abụọ. Ha chọpụtara na tupu ihe bekee kpọrọ Treasury Single Accounts apụta ihe, ndị ụlọọrụ Jamb nọ na-etinye ego ha retere n'ime akpa ego a na-akwadoghị, nke butere ofufu ọtụtụ ijeri naịra. Chieshe gwara Efcc ""Ego a m na-ewepụta, onye nhazi na-eji ya eme ihe ndị gbasara ụlọọrụ nakwa onwe ya ụfọdụ oge."" O kwukwara n'oteela o bidoro ịdọ Umoru aka na ntị, sị na o kwesịghị iji ego ahụ mee ụmụ ururu ihe dị n'ụlọọrụ nakwa ihe gbasara onwe ya, mana ọ kweghị ege ya ntị. O kwukwara ma Umoru nọ na-amịpụ 'eji m gị ụgwọ' site n'ego ha retere na kaadị ahụ kwa mgbe, n'akwụghachịghị ya. Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb Chieshe kwuru ""Ọ gwara m dọpụtara ya N640,000 n'etiti ụbọchị 30 nke ọnwa Juun na ụbọchị 7 nke ọnwa Julaị nke 2014."" Ọ kwukwara na ọ dọpụtakwaara ya N120,000 na N340,000 site n'ọnwa Mee ruo Julaị. Ndị nyocha chọpụtara na ọ bụ eziokwu na Umoru dọpụtara ego ndị a ka ha nyochachara akwụkwọ nkọwa nke akpa ego Chieshe. Anwụchiri ma gbaa Umoru ajụjụọnụ tupu a hapụ ya ka ọ gawa. Otu onye Efcc kwuru sị ""Ihe kacha akpalite uche na nkwuputa a bụ na anatala ndepụta Chieshe tupu mgbaama agwọ na ego oloro apụta ihe. ""E bu ụzọ gbaa ya ajụjụọnụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwarị 2017 ma mekwaa nkwuputa n'ụbọchị 7 nke Epreelụ, ụbọchị 30 nke Mee na ụbọchị 28 nke Juun 2017. N'ime ihe niile ọ gwara n'ihu ndị Efcc, onweghị mgbe ekwuru okwu gbasara agwọ na ofufu ego dị n'aka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43031981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43031981,Ụlọikpe: Ndị Boko Haram ga-enweta ikpe ruru ha,"Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala.","Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ. Ikpe nke a bụ nke kachasị n'ikpe a na-ama ndị na-eyị ndụ ekwu n'ala Naịjirịa. Ihe karịrị ndị ọkaịkpe anọ ga-ekpe ndị a ikpe n'ụlọ mkpọrọ ndị agha. Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ A kwụsịrị ikpe n'ịme ọnwa anọ gara-aga, iji nye ohere ka ndị nchekwa mee nyocha gbasara ndị Boko Haram. dịka Mịnịstịrị na-ahụ maka ikpe ziriezi kwuru. N'ọnwa ọktoba 2017 bụ mgbe ikpe a malitere, amara mmadụ iri anọ na ise ikpe ị ga mkpọrọ afọ atọ rue afọ iri atọ na otu, ebe atọhapụrụ ihe karịrị mmadụ narị anọ maka nweghi ihe aka ebe megidere ha. A na-atụ anya ị ma kwa ọtụtụ ndị otu a ndịọzọ ikpe n'ọge n'abịa abịa. n Cheta na ndị Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009" afirika-49612847,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49612847,Lilian Esoro sị na akụkọ na ọ dịrị Blossom Chukwujekwu ime na-atọ ọchị,Lilian Esoro bụ onye e ji ime ejije na Nollywood mara sị na o nweghị ihe ọbụla o nwere ikwu maka ebubo ịnara mmadụ di ya e boro ya.,"Onye mbiputa akụkọ bụ Stella DimokoKorkus dere sị na Esoro dị ime nwa onye ejije ibe ya bụ Blossom Chukwujekwu. Mana esoro gwara BBC Igbo n'ekwentị sị na ọ gaghị ekwu ""pịm"" maka okwu ahụ makana e nweghi okwu dị ya. Kama n'elu ihe a na-akpọ ""Instagram story"" ya na soshal midia, o dere sị ""e kelekwaa m unu"" ma na-achị ezigbo ọchị. O dere nke a ka akụkọ na-efegharị na ọ dị ime N'otu aka ahụ, BBC Igbo gbalịrị inweta Chukwujekwu n'ekwentị nke ya mana o bulighị ya, mana o tinyere foto ebe ọ na-achị ezigbo ọchị n'elu Instagram ya ka aha ya na-efegharị. O dere na foto ya sị na "" Ana m"" wee tinye foto ebe ọ na-achị ọchị Kedụ ihe butere akụkọ a? Dimokokorkus e ji 'SDK 'mara dere akụkọ na Chukwujekwu akwarala ngwongwo ya si n'ụlọ ya na nwunye ya bi kemgbe afọ 2016 ha lụrụ, kwapụ. O kwuru na nke a mere makana Esoro dị ime nwa ya. Okwu si n'ime ya pụta: Ndị mmadụ malitere ịkpa maka Esoro na Chukwujekwu makana ha bụ ndị na-ewu ewu. Aha ha malitere iwu n'elu Twitter, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ pụtara na Esoro nwere obi ime nwaanyị ibe ya ụdịrị ihe ya na onwe ya gabigara oge ọ lụburu Ubi Franklin. @barbie_juliet04 kwuru na o che na enweghi ihe ga-esenwu okwu n'etiti Chukwujekwu na Maureen nwunye ya. @ehte_ na-ajụ etu Esoro si hapụ di ya maka ụdịrị ihe a wee soro di mmadụ. @tascaramel2 kwuru sị na ebe ọ bụ na Esoro nwere obi ime nwaanyị ihe a, na ọ maghịzị anya ọ ga-eji na-ele ndị mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye" afirika-49452316,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49452316,Child Trafficking: A nwụchiela nwaanyị rere nwa ya,"Ndị uweojii Imo Steeti nwụchiri otu nwaanyị rere nwa ya n'ọnụ ego dị puke naịra 500 n'ụbọchị 1 Ọgọst, afọ 2019.","Nke dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steti bụ Ikeokwu Godson Orlando wepụtara. Nwaanyị a kpọrọ Chinasa Ukoha dị ime ọnwa asatọ ma hapụ ụlọ ebe ọ gwara di ya na ọ na-aga n'ụlọ nwanne ya n'obodo Ubomiri dị na Mbaitoli. Mana di ya bụ Promise Ukoha mechara chọpụta na Chinasa nwunye ya tụrụ ya asị ọcha. Dịka otu ọnwa gachara, Promise nwetere ozi n'ekwentị na nwunye Chinasa mụrụ nwa nwụrụ anwụ. Mgbe ọ sịrị ka e gosi ya ozu nwa ya ahụ, nwaunye ya gwara ya na okechiri ya n'akpa wakịrị wakịrị ma tufuo ya. Mana di ya wepụrụ akụkọ n'aka ndị uweojii nke mere ha ji malite nyocha banyere nke a. Ndị uweojii nwụchiri Chinasa, onye mechara kwuo na o rere nwa ahụ, resi ya n'aka Amadi Chioma n'ọnụ ego puku naịra 500. Chinasa sị ndị nọọsụ abụọ bụ Dorathy Esemonu na Eke Cathrine nyeere ya aka ree nwa ya ahụ. Dịka ọ dị ugbua a chọtala nwa ahụ ebe nyocha na-aga n'ihu banyere ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44934495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934495,Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha,"Ka ndị mmadụ nụrụ na ndị EFCC gbochiri ndịisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na Ike Ekweremadu ịpụ n'ụlọ ha n'ụtụtụ a, ha etinyela ọnụ na ya bụ okwu.","Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị EFCC gbochiri ya ịpụ maka na ọ kwesịrị ịnọchi Saraki dịka na nzukọ ụlọomeiwu taa. Ebe onye enyemaka Saraki bụ Banks Omishore, tinyere na Twitter na EFCC nyachiri ihu ụlọ ya ka ọ ghara ịpụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Ndị Naịjirịa tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ onyeisiala na-emegide Saraki, ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-emegide ọkwa onyeisi ụlọomeiwu ukwu. @atiku bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala kwuru sị na ndị ọchịchị ekwesịghị ime ndị omeiwu ha ka ndị ohi. @OgbeniDipo kwuru na ọ bụ Buhari na Saraki na-ama aka. @Omojuwa kwuru na ọ bụ mkparị nye ọkwa onyeisi ụlọomeiwu. @Ogundamisi kwuru sị na igbochi Saraki bụ imegide ọkwa ya. @KelvinOdanz kwuru sị na-ejiri ego e ji achụ Saraki lekọta ezigbo mpụ dị n'obodo, na Naịjirịa ga-adị mma karịa etu ọ dị. BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ha ihe ha che gbasara ihe na-aga, lee ihe ha kwuru: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45380900,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45380900,Ndị Enugwu ayọọla gọọmenti ka ha gbatikwuo ụbọchi inweta PVC,"Inweta PVC n'Enugwu dịka ịnyịnya ịgafe n'ọnụ aga, dịka nchọpụta BBC Igbo mere.","Iwe ji ndị anatabeghị PVC n'Enugwu Onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụọnụ n'ogige isi ụlọọrụ Enugwu Sentralụ kwara arịrị na kemgbe ụbọchị ole ma ole na ha enwebeghị ike inweta PVC. Ha boro INEC ebubo na e nwere ihe ọjọọ ha bu n'uche mere ha jị eke ya na naanị otu ebe n'okpuru ọchịchị ọbụla. Nke a mere ha ji agabiga ahụhụ inweta ya. N'Owo bụ ebe ndị Enugwu North n'ewere nke ha, ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'mmiri nakwa anwụ na-eche ma ha ga- enwe mmeri. Inweta PVC n'Enugwu dịka ịnyịnya ịgafe na-ọnụaga Nwabueze Adimchi bụ onye gbara afọ iri n'itoolu kwuru na nke a bụ izizi ya chọrọ inweta ya bụ PVC wee kwaa arịrị na ya chọrọ iji ya tụọ vote nke mbụ na ndụ ya. Ndị ọzọ gunyere Caleb Obi, Cosmas Anyanwu jị obi mwute gwa gọọmentị ka ọ nyekwuo oge ka nweta nke ha. Kirie ma gee ihe ha kwuru na ihe nkiri dị na-elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49937038,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49937038,Anambra State: Ihe akụ ọnatarachi juru na steeti a,Ahịa otu nkwọ Ọnịcha n'Anambra Steeti bụ ahịa kacha ukwu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka niile.,"Ụmị mmanụ agbidi Nke a mere na e kwuo okwu ịzụ ahịa na Naịjirịa, a ga-akpọrịrị Anambra. Nke a pụtara na-achụcha ya bụ aja ma ahụghị udele, mara na ihe mere be ndị mmụọ. Mana ọbụghị sọ ahịa ka steeti a ji dị ebube. Ha nwekwara ihe akụ ọnatarachi dị icheiche juputara n'ala ha. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a dịka ụlọọrụ 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta: 1) Mmanụ agbidi Ụmị mmanụ agbidi Agbanyeghi na Anambra esoghi na steeti ndị a ma ama na Naịjiria na-emepụta mmanụ ala, nke ahụ apụtaghị na ha enweghị mmanụ n'uju. Okpuru ọchịchị Anambra, Mbamili nakwa Ogbaru nwere mmanụ ala nke ọma. Gaasị dịkwa na mpaghara ndị ahụ n'uju. 2) Kaolin 'Kaolin' 'Kaolin' bụ ụdị nkume pụrụiche e nwere ike iji mee 'Ceramics', maọbụ werekwa ya rụọ ọgwụ. E jikwa 'Kaolin' arụpụta ude na-edozi anụ ahụ nakwa ihe e ji eme ka eze na-egbuke ọcha. Dịka webụsaịtị 'statista.cọm' si depụta, a na-ere 'Kaolin' $140 maka otu tọn. Mpaghara Aguata, Ayamelum, Ihiala, Njikoka na Nnewi, nwere Kaolin n'ala ha. 3) Pyrite Pyrite 'Pyrite' bụ ụdị igwe (metal) pụrụiche na-egbuke egbuke e si n'ala egwupụta. A na-eche na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdị n'okirikiri ahụ. 'Pyrite' na-enwekwa ajịrịja ọlaedo n'ime ya nke bụ na a gbarie ya, e nwere ike ịnweta kịrịkịrị ọlaedo. A na-ejikarị ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, nakwa ọla ndị ọzọ e ji eji ejiji. Mana ọ galaghị oke ọnụ dị ka ọlaedo. Ị ga-ahụ 'Pyrite na mpaghara Ọnịcha Nọt na Ọnịcha Saụt nakwa Oyi. 4) Lignite 'Lignite' bụ ihe dịka unyi (coal) Ọ na-esi n'osisi kpọnwụrụ akpọnwụ nke relara n'ala puku kwuru puku afọ gara aga apụta. A na-akpọkwa 'Lignite' 'Brown Coal' maọbụ 'Brown Diamond'. E nwere ike iji 'Lignite' emepụta ọkụ latrik. Kama ndị ọkacha mara kwuru na 'Lignite' adịghị mma maka na ọ na-ebute mgbanwe ihu eligwe nke a kpọrọ 'climate change'. Ọkụ latrik e ji ya mepụta na-aka adị ọnụ ala karịa nke e ji 'coal' maọbụ gaasị mepụta. Lignite dị na mpaghara Idemili West, Nnewi North nakwa Ọnịcha Not na Saụt. 5) Sand stone Sand stone 'Sand stone' bụ ụdị okwute si n'aja ọcha apụta. Okwute a na-egbuke egbuke ma makwaa mma ile anya. Mana o sichaghị ike dị ka nkume ndị ọzọ. Ya mere a na-eji ya edozi ahụ ụlọ maọbụ achọ ya mma. I gaa na akụkụ Aguata ụfọdụ, Aniocha, Idemili, ị ga-ahụ 'Sand stone' nke ọma. Ọ dịkwa na akụkụ ụfọdụ n'Ọnịcha nakwa Oyi. 6) Lateritic Clay Nke a bụ aja ụpa pụrụ iche E ji ya arụ ihe dị icheiche dịka ụzọ nakwa akụrụngwa ndịọzọ e ji arụ ụlọ. A na-ahụ aja ụpa a n'ọkụ iji mee ka ọ kpọọ nkụ ma sie ezigbo ike tupu ewere ya rụpụtawa ihe dị icheiche. 'Laterite' bara ụba n'okpuru ọchchị Orumba Nọt na Saụt. 7) Iron Stone 'Iron Stone bụ ụdị nkume pụrụiche. Ọ na-enwetụ kịrịrị igwe n'ime ya. Ụfọdụ na-enwekwa kịrịkịrị ọlaedo n'ime ha. Ihe ejikarị ya eme bụ ịgbari ya iji nweta igwe maọbụ ọlaedo dị n'ime ya. E jikwa ya arụ ụlọ. Mana ọbụchaghị okwute dara oke ọnụ ahịa. Ebe ụdị nkume a dị bụ n'akụkụ ụfọdụ n'okpuruọchịchị Anambra East nakwa Orumba Nọt na Saụt. Ihe akụ ndị a nwere ike ime ka nnweta ego bawanye na Anambra ma ọ bụrụ na gọọmentị steeti ahụ na gọọmentị etiti jikọọ aka ọnụ. Anambra nwekwara ala na-amịpụta nrị nke ọma, na-agbanyeghị na mbuze na-enye nsogbu ebe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?" afirika-50114868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114868,USSD meaning: Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD,"Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Dkt Isa Ali Pantami enyela iwu ka MTN gbaa ""brake"" n'ịnapụ ndị mmadụ naịra anọ n'elu USSD.","O kwuru na ọ maghị maka ozi a, nke mere na ọ gaghị aga n'ihu maọbụghị ma o doro ya anya bụ ihe ha na-eme. End of Twitter post, 1 Nke a mere ka o zigara ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ 'Nigerian Communications Commission (NCC)' ozi, ka ha kwụsị atụmatụ a ruo mgbe ha tulechara ya. Nke a na-abịa dịka ndị MTN zipuru ndị mmadụ ozi sị na ""bido ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba, anyị ga-amalite ịna naịra anọ kwa nkeji 20 ị nwara iji USSD gị"". MTN zipụrụ ozi maka ịna ndị mmadụ ego MTN kwuburu na ndị ụlọakụ ga-akọwara ndị mmadụ maka atụmatụ a dịka ụbọchị na-aga. Gịnị bụkwanụ USSD a? Dịka Bekee si kwuo, ""Unstructured Supplementary Service Data (USSD)"" bụ ihe ndị mgbasaozi ekwentị na-eji ekesa ozi (text message) n'etiti ekwentị na ihe Bekee kpọrọ 'Application' maọbụ App n'ịchafụ. Ọmụmaatụ etu USSD si arụ ọrụ bụ etu a ụlọakụ GTB nwere *737# ị ga-ejinwu kwụọ ụgwọ maọbụ zụọ ihe na-efu. Mana atụmatụ ndị MTN wepụtara bụ nke a gọọmentị machiri, bụ na a ga-ana gị ego iji mee ya bụ ihe ego ị chọrọ ime na-ejighi App ndị ụlọakụ gị. Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya @MistaChika sị na ịgbanarị ya bụ ụgwọ USSD, na ọ kaara gị mma na i ji App gị na-akwụ ụgwọ ihe ọbụla. @_extreme kọwara na ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na ị nweghi ""data"" ị gaghị ejinwu ekwentị gị azụ ihe ọbụla dịka ego e ji akpọ n'ekwentị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: ""Igbaji ụkwụ emeghị m onye arịrịọ""" afirika-52795558,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52795558,Nnamdi Kanu akpọọla oku ka e buo ọnụ abalị atọ iji cheta ndị nwụrụ agha Biafra,"Onye ndu otu na-achọ mmereonwe Biafra, Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola ka ndị nso ya buo ọnụ abalị atọ iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.","Obubu ọnụ a ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Mee ga-ebi n'ụbọchị iri abụọ na itoolu n'ọnwa mee kwa. Dịka o si kwuo n'akara Twitter ya, ọ kọwara na ""aja ndị agha ahụ chụrụ agaghị ana n'iyi"". End of Twitter post, 1 ""Tọghapụnụ Rotimi Jolayemi"" Otu ndị na-agba mbọ maka ikike diri onye akatọọla njichi e jichiiri otu onye ntaakụkọ Rotimi Jolayemi kemgbe abalị iri na asaa nke ọnwa Mee maka ikwu okwu ọjọọ megide Mịnịsta mbasaozi bụ Lai Mohammed. Rashford na Pogba adịla njikere - Ole Gunnar Solskjaer Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta otu Manchester United ekwuola na Marcus Rashford na Paul Pogba dị njikere ịgba bọọlụ mgbe ọ ga-ebido. Cheta na Rashford na Pogba gara ezumike maka ahụ ha merụrụ tupu akwụsị asọmpị kpam kpam n'ihi coronavirus. Ọkụ erepịala ngwaahịa nde kwuru nde n'ahịa Asaba Ọkụ na-agba na foto a abụghị nke gbara n'ahịa Asaba Ndị uweojii na Delta ekwuola na ọkụ gbara n'ahịa Ogbogonogo nke dị n'Asaba Delta steeti. Ọnụ na-ekwuchitere ha na steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya kọwara na a kpọrọ ha ebe elekere asaa nke isi ụtụtụ na ọkụ na-agba n'ahịa ahụ. ""O nweghi onye nwụrụ n'ọdachi ahụ, mana anyị ka na-enyocha iji chọpụta ihe mere ọkụ a jiri gbawa"", ka ọ gwara BBC. Ụmụnne egbuola nwanne ha maka ego a tụkọtara iji lie nne ha Nke a bụghị nke mbu a na-enwe ogbugbu site n'esemokwu di n'etiti di na nwunye. Ụwa di egwu oo. Ụmụnne egbuola nwanne ha ebe ha na-adọ ndọrọndọrọ gbasara ego a tụkọtara maka ili nne ha nwụrụlanụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikeokwu Orlando kwuru na ihe a mere n'Obowo dị n'Imo steeti. O kwuru na ọ bụ ebe ụmụnne anọ ahụ na-adọ ndọrọndọrọ ka otu onye n'ime ha were mma magbuo otu n'ime ha aha ya bụ Patrick Obieshieke. O kwuru na mmadụ atọ ahụ lụsara Patrick ọgụ gbapụrụ mgbe ha hụrụ na ọ nwụọla. Ndị uweojii ka na-achọ ha kamgbe ụbọchị Fraide gara aga mgbe ihe a mere ruo ugbua ma ka na-enyocha etu o si mee. Etu esi zọpụta ụmụnwaanyị 50 a tụrụ mgbere na Lebanon A zọpụtala ụmụnwaanyị Naịjirịa dị iri ise, bụ ndị a tụrụ mgbere na mba Lebanon ma kpọlata ha Naịjirịa. Dịka ọ dị ugbua e dosala ha n'ọnọdụ mwezuga onwe iji kee nkwụcha maka coronavirus ma a ga-agba ha ajụjụọnụ ịmata ka ha iji si wee gaa. Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama kwupụtara nke n'akara twitter ya sị na gọọmentị mba Lebanon nyere aka n'ịkpọlata ndị a. Ụmụnwaanyị ndị so n'ime ndị Naịjirịa dị iri isii na itoolu si Lebanon bata site n'enyemaka gọọmentị ha. Uru dị n'ime anụ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ gburu Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwanyanwụ ehiwela atụmatụ ndị ha kwuru ga-enye aka ka ala Igbo tolite nke ọma. Atụmatụ ndị a bụ nke ha hiwere n'ọgbakọ ha n'Enugwu Steeti n'ụbọchị Sọnde metụtara nchekwa, ọrụ, azụmaahịa, nwulite obodo dgz. Nke a si n'akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ gọvanọ Dave Umahi wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ha ahụ. Ụfọdụ mkpebi ha rụtụrụaka gụnyere; 1.Ha chọrọ ka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC n'ịchafụ ka ha welitekwuo aka n'ime nyocha maka ọrịa coronavirus na mpaghara ọwụwanyanwụ. 2.Ha sị onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ laghachị na nkwekọrịta ha gbasara nchekwa ime obodo nke bụ sị 'ndị omeiwu n'ọwụwanyanwụ mee iwu gbasara nchekwa ime obodo nke gbadoro ụkwụ na South East Joint Security programme. 3.Gbasara iwulite akụnaụba, ha kwekọrịtara na ha na ọtụ dịka 'World Bank', 'Central bank Of Nigeria', 'Nigeria Sovereign Investment Authority (NSIA)', nakwa 'Federal Govrenment of Nigeria (FGN)' ga-arụkọ ọrụ n'ihe gbasara ọrụ ugbo, SME na ọnatarachi. 4.Ha gakwara n'ihu kwuo na ha na ndịisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) ga-ezukọ n'elu intaneti ma kpaa ka ha ga-esi jikọta okporo mmanụ gọọmentị etiti na nke isi obodo niile dị n'ọwụwaanyanwụ nke sirila Imo steeti ruo Legọs. 5.N'ihe banyere ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu Steeti, ha kelere onyeisiala Buhari nakwa minista na-ahụ maka njem ụgbọelu maka ọganihu ọrụ n'ebe ahụ ma kwee nkwa na ha nwere olileanya na a ga-emepe ya na nso nso a. 6.Ha kelekwara onyeisiala Buhari nakwa gọvanọ Willie Obiano nke Anambara Steeti maka ọrụ na-aga n'ihu n'akwa mmiri Niger nke abụọ. 7.N'ikpeazu ha kwuru ka ndịisi Ohaneze Ndigbo weta akwụkwọ ga-enyeaka n'ihiwe ihe a kpọrọ ""South East Stabilization Fund"" maka enyere ndị mmadụ aka. Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-50849059,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50849059,Sotitobire Church: Etu akụkọ ụgha si bute igbu onye uweojii na ịgba ụlọụka ọkụ,Ndị mmadụ gbara ụlọ uka Sotitobire dị n'Akure ọkụ ụnyaahu maka akụkọ ndị uweojii si bụ asị na-efere na soshal midia.,"Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu na ụlọụka ahụ. Nne nwatakịri a bụ Modupe Kolawole kpọ ya ga ya bụ ụlọụka mgbe atọrọ ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo steeti bụ Femi Joseph gwara BBC na ọ bụ ndị iwe na-ewe gara na ya bụ ụlọụka were gbaa ya ọkụ n'ihi na akụkọ si na-abọpụtara ozu nwantakịrị ahụ n'ụka ahụ. Nne ya bụ Kolawole gwara onye ntaakụkọ BBC na-enwere aka enwe n'ihe gbasara ofufu nwa ya. Kolawole kwukwara na ndị ụlọụka ahụ enyeghi ndị uweojii enyemaka dịka ndị chọrọ ka achọta ya bu nwa. Kama onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ọhụghị ozu nwa ahụ n'ụlọụka ahụ. Ndị uweojii sitere na ọnu na-ekwuchitere ha bụ Femi Joseph kwuru na ọ bu akụkọ ụgha dughere ndị mmadụ iji chee na ọ bụ eziokwu na egwụpụtara ozu ya bu nwa. Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga Joseph kọwara na igwe mmadu iwe na-ewe gburu otu onye uweojii ma sị kwa na ọ bụ ihe onyonyo ụlọmgbasa ozi wepụtara bụ ihe mere ka akụkọ ugha a gbasaa ka ọkụ n'oge ụgụrụ. O kwukwara na igwe mmadu a jiri okwute chụọ ndị uweojii ọsọ ụkwụ eruala ma mebie ụgbọala ha. Kama o kwuru na ọ bụghi eziokwu na ndị uweojii gburu onye obụla. Onyeuweojii Joseph gwara ndị mmadụ na ha ka na enyocha ya bụ ofufu nwatakịri a bụ Gold Kolawole. Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụụ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. Lee ihe ndi mmadụ na-ekwu maka ya Lee foto sị ebe ahụ pụta: Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51535539,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51535539,Delta State: Anyị abọpụtala ozu mmadụ itolu ndị ọchịehi gburu - LGA Chairman,Akụkọ na ndị ọchiehi wakporo ndị obodo Uhwerụ nke dị n'okpuru ọchịchị Ughelli ebutela ọtụ kepukepu na nghọtahe.,"Ufọdụ ndị obodo dị na mpaghara ebe ndị ọchịehị nọ ebidola ị chekwa onwe ha Nke a na-eme dịka ndị obodo sị na ndị uweojii ekwuputaghị na-ezie mmadụ ole ndị ha si bụ ndị ọchiehi gburu. BBCIgbo mere nyọcha ka enyọchapụta nke bu eziokwu. BBCIgbo kpọtụrụ onyeisioche okpuruọchịchi Ughelli Nọt ka ọ jiri ọnụ ya kwuo ihe na-eme na ihe mere. Onyeisioche ọkpuruọchịchi a bụ Godwin Adobe kwuru sị na ọ bụ ozu mmadụ itolu ka ha chopụtarala. O kwukwara na otu onye merụrụ ahu ọnodụ ya dị njọ ka ha zịkarala ụlọọgwụ mahadum nke dị na Bịnị, ebe ụfọdụ ndị ọzo gara ịnweta ngwọta ebe ndị ọzọ. Adobe kwuru na ọmaghị ihe butere mwakpo a wakporo ndị obodo Uhweru. O kwukwara sị "" anyị butere ozu atọ n'ụbọchi sụnde, anyị butekwara ozu isii ọzọ echi gara aga (Mọnde) na ụbọchị frịde ka e buru otu ozu bụlaa ala nna ya dị na obodo Isoko maka olili"". Adobe kwuru na ọ bụ ozu itolu ka ha chọpụtara ma sịkwa na ndị nchekwa na ndị uweojii nọ na obodo Uwheru maka ihe mere. Ihe ndị uweojii nwere ikwu Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya gwara BBC na ọ bụ ozu mmadụ asatọ ka ebutere ha. Onvowakpoyeya sị na ọ bụ ndị obodo bụpụịtara ozu ndị ahu were bute ya n'ụloọrụ ndị uweojii. Odeakwụkwọ Mgbasaozi Abia State. O kwukwara na obodo ahụ ederela juu ma sị kwa na enwebeghị onye ha nwụchiri maka mkpamkpa kpara n'obodo Uhweru. Ọ sị kwa na ha ka na-eme nyocha ịmata ndị kpara mkpa mkpa. Akụkọ ga-amasi gị" 44050398,https://www.bbc.com/igbo/44050398,Ebola: DR Kongo ekwupụtala na ọrịa ahụ ebidola ọhụrụ a,E kwuola na Ebola abịala ọzọ na mpaghara ugwu mba DR Kongo.,"Ebola bịara na Naịjirịa na 2014 mana gọọmenti Naịjirịa jidere ya nkeọma A chọpụtala mmadụ abụọ bu ọrịa ahụ ebe mmadụ 17 nwụrụla, dịka ndị ọrụ ahụike na mba ahụ kwuru ụbọchị Tuzde. Ihe mberede ọhụrụ a mere n' obodo Bikoro na-abịa dịka ọ karịrị otu afọ ọrịa ahụ gburu ọtụtụ ndị mmadụ na mba ahụ. N'afọ 2014, ihe karịrị mmadụ 11,000 nwuru na mba Gini, Siera Lionu na Liberia. Cheta n'afọ 2014, onye mba Liberia, Patrick sawyer bu Ebola batara Legos we kesaa ya. Ndị nwụrụ na ya bụ bụ ọrịa na Naịjirịa bụ mmadụ asatọ, anọ n'ime ha bụ ndị aọrụahụike letara Sawyer, ebe ndị ọzọ a kpọpụrụ maka na a na-enyocha mechara gbakee. A chọpụtara maka ọrịa ahụ ọzọ oge mpụtara nyocha e mere gosipụtara ọrịa ahụ na mmadụ abụọ n'ime mmadụ ise a na-enyo enyo bu ọrịa ahụ dịka ndị ọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health organisation( WHO) siri kwuo. N'okwu onye ọrụ WHO bụ Peter Salama; ""Ihe kachasị anyị mkpa bu inweta Bikoro ka ha soro gọọmenti ha rụkọọ ọrụ."" ""Ndị mmadụ ịrụkọ ọrụ ma zaghachị ọrịa ahụ n'usoro ziri ezi ga-enye nnukwu aka ijide ọrịa ahụ otu ebe."" WHO kwuru na ha ewepụtala ego ruru otu nde dọla site n'ego gbatagbata ebe ha ziterela ihe ruru ndị ọrụ ahụike mmadụ 50 ka ha na ndị gọọmentị DR Kongo rụkọo ọrụ. Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara Nke a bụ ugbo itoolu a na-enwe Ebola na DR Kongo. Ya bụ ọrịa bidoro mbụ n'afọ 1976 (oge a mara mba ahụ dịka Zaire). Aha ọrịa ahụ sitere n'otu mmiri dị n'obodo ahụ a na-akpọ Ebola. A na-eche na ọ bụ ikwuikwui na-ata mkpụrụ osisi na-ekesa Ebola ahụ nke mmadụ na-ebute site n'iri anụ ọhịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43005011,https://www.bbc.com/igbo/43005011,Ụlọikpe enyela iwu ka anwụchie Innoson,Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie Chukwuma ma kpụta ya n'ụlọikpe ụbọchị anọ nke ọnwa March.,"Innocent Chukwuma Cornel Osigwe bụ ọnụ n'ekwuru Innoson group kwuru nkea na-mkpakọrịta uka ya na ndị BBC. A na-ebo Chukwuma na o hiri asaa na anya jụ ị za oku ụlọikpe kpọrọ ya tata bụ Afọ 9/2/18. Mana Cornel Osigwe siri na ụlọikpe e nyeghị Chukwuma akwụkwọ ị bia za oku ahụ. Dika o siri kwuo, ọ bụ na-asịrị ka ndị ọkaikpe ya nuru ya bụ oku were si ka ha bia mara ma ọ bụ eziokwu. Ndị ọkaikpe Chukwuma kọwatara ụlọikpe na ọ nweghị ha ji nwete akwụkwọ ya bụ oku. Mana Jọstis Mojisola Dada na-ahu maka ya be ikpe gara n'ihu si ka anọrọ n'ụlọike ahụ nye nay akwụkwọ oku ọzo. Ndị ọkaikpe Chukwuma yọro ụlọike ka ha zitere ya akwụkwọ oku dika iwu obodo siri kwuo karia ị nye ya akwụkọ n'ihu ụlọikpe. Dika Cornel Osigwe siri kwuo, ọ sịrị na ya na-enyo na aka enwe dị na ya bụ ofe. Ka ọ dị ugbua, Ndị ọkaikpe Innoson Chukwuma a gala ị hụ ịkpesara ụlọikpe nke Appeal ka ọ nyere ha aka mee ka e zitara Chukwuma akwụkwọ oku dịka iwu obodo siri kwụo. Na ọnụ okwu ya "" Innoson bụ o ji ego acho ego a maama, ọ naghị atụegwu ị za ụloikpe oku""." afirika-44817617,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44817617,Ihe mere ụmụ Naịjirịa ruru '200' jiri tọọ na Russia,Otu onye Naịjirịa bi na Rọshịa aha ya bụ Kehinde Oluremi agwala BBC Igbo na aka na-achị Legọs steeti bụ Akinwumi Ambode kwụrụ ụgwọ iji kpọlata ụmụ Naịjirịa 50 tọọrọ na Rụshịa.,"Nke a na-eme ka onyeisi ngalaba abụghị nke gọọmentị na-ahụ maka ndị a na-emekpa ahụ akpọrọ Alternativa bụ Yulia Siluyanova gwara BBC na ụlọọrọ na-anọchịte anya Naịjirịa na Rọshịa etinyela ndị Naịjirịa tọọrọ na mba ahụ n'ọlụ ndina. Cheta na akụkọ pụtara ụnyaahụ na ndị aghụghọ ghọgburu ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gara Rọshịa maka Iko Mbaụwa n'iresị ha akwụkwọ njem ezụghị ezụ, nke mere ọtụtụ n'ime jiri tọọ na mba ahụ. Oluremi gwara BBC Igbo na ihe a Siluyanova kwuru bu eziokwu ma gaa n'ihu kwuo na ọ bụ ihe a kpọrọ ""Fan IDs"" ndị gọọmentị Rọshịa nyere ndị mmadụ iji bata mba ahụ ka aha jiri bịa mba ahụ na nchekube na ha ga-enweta ọrụ maọbụ inweta otu asọmpi. Kenny kwuru na ""Fan ID"" a bu ihe mba Rọshịa nyere n'efu, mana ndị mmadụ na-ere ya na Naịjirịa. O kwukwara na ọbụghị naanị ikiri Iko Mbaụwa ka ụfọdụ mmadụ bịara ime na Rọshịa, makana ọtụtụ chọrọ isi Rọshịa gawa Yurope. Ọ sị na ndị nọ n'ọnọdụ a tọọrọ makana ndị haziri njem ha kagburu akwụkwọ njem ha kwesiri iji lọta. Oluremi kwuru na ọ bụ otu onye na-arụ ọrụ n'otu ụgbọelu ama ama tinyere ihe karịrị pacent 60 n'ọnọdụ a. Ndị Naịjirịa ruru 200 nọ bụ n'ọdọ ụgbọelu rue nwanne ụnyaahụ mgbe Alternativa gbalịrị kpọrọ ha gawa ụlọọrụ ndị na-ahụ maka Naịjirịa n'ime abalị. Siluyanova gwara BBC na ekweghi ka ndị a banye n'ime ụlọ ""Embassy"" ahụ, mana Oluremi kwuru na ihe mere bụ na ụlọọrụ ahụ emechiela ọrụ mgbe ahụ. O kwukwara na Sammy Davies bụ onye na-anọchịte anya Naịjirịa na Rọshịa gbara mbọ kasie ụmụafọ Naịjirịa obi, ma kpọrọ ha gawa ụlọ ndịna. BBC Igbo nwetere otu onye ihe a metụtara n'ekwentị (ọchụghị ka anyị kwuo aha ya) o wee kwuo na ọ bụ eziokwu na etinyere ha n'ụlọ ndina ahụ, ma gwaa n'ihu kwuo na ọ bụ ụgwọ abalị ise ka Davies kwụrụ. ""Akwụụrụ anyị ụgwọ abalị ise, ma kwekwa anyi nkwa na anyị ga-ala, mana anyị amabeghi ihe ga-eme ma oge ahụ gafe,"" Nwaamadị a kwuru. Ọ kwukwara na ya nụrụ maka enyemaka gọvanọ Ambode nyere ndị mmadụ, ma sị na ha nwa apuọla n'ọdọ ụgbọelu mgbe nke a mere. Siluyanova kwuru na ya na ndị otu ya na-ebugara ndị a ihe a metụtara nrị kwa ụbọchị, ma kwuo na mgbe ha kpọtara mmadụ 55 na ""Embassy"" Naịjirịa, onweghị onye pụtara bịa hụ ha. ""Sọsọ onye anyị hụrụ bụ Kenny (Oluremi Kehinde), sị na ya bụ onye enyemaka. Onweghi onye anyị hụrụ,"" Siluyanova gwara BBC. Sammy Davies bụ onye na anọchịte anya Naịjirịa na Rọshịa na ndị Naịjirịa na Rọshịa tata Ndị na-enweta ""Fan ID"" Oluremi gwara anyị na ""mgbe anyị ruru ebe a, anyị chọpụta na onye ahụ nara anyị ego tụọrọ anyị asị."" ""Fan IDs"" a ndị Rọshịa nyere na-enye ndị sị mba ọzọ aka ịbata Rọshịa na-ejịghị akwụkwọ eji aga mba Bekee Kpọrọ ""Visa"". Ikike ""Fan ID"" ga-emebi na ngwụcha Julaị. A na-enye ndị nkwado otu egwuregwu di icheiche zụrụ akwụkwọ eji ekiri asọmpi Iko Mbaụwa ""Fan ID"" n'efu. Mana ndị ọ dị n'aka ha resiri ya ndị Naịjirịa chọrọ ịga Rọshịa ga rụo ọrụ. Amabeghị etu ndị a jiri nwete ""Fan IDs"" a ha resịrị ndị mmadụ. AFP kwuru na otu onye na-arụ ọru n'otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile bụ FIFA kwuru na ọ bụ ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na Rọshịa nyere akwụkwọ a. Gọọmentị Rọshịa ekwuola na ịkpọla ndị tọọrọ dị na-aka gọọmentị Naịjirịa ""FIFA ga na-agbambọ ịhu na-enwetere, ma kagbuo ire akwụkwọ adịgboroja,"" onye a gwara AFP. Ndị Naịjirịa tọọrọ Oluremi kwuru na-ekwesiri ịgba mbọ kpọlata ndị Naịjirịa maka oge atụma oyi na-abịa n'ike, ọkachasị na ọtụtụ ndị a bịara Rọshịa enweghi akwa eji egbochi oyi. ""Biko, ka eme ngwa ngwa kpọọla ndị a maka n'akpachaghị anya, ọ bụrụ ozu ka anyị ga-ebula,"" Oluremi Kwuru. Onye ihe a metụtara anyị gbara ajụju ọnụ kwuru na ha chọrọ enyemaka ma rịọ ndị Naịjirịa ka ha echezola ha na Rọshịa. ""Anyị chọro ịlaghachị obodo anyị. Anyị ebeela akwa, mana anyị ahụbeghi etu a ga-esi me ya bụ ihe."" Oluremi na onye anyi gbara ajujụ ọnụ kwuru na ọ bụ otu nwoke a na-akpọ Maxwell na-arụ ọrụ na Turkish Airline bụ onye aka ya kachasị dị na ""mpụ"" a kpọsara ha na Rọshịa. BBC Igbo jụrụ ụlọọrụ ụgbọelụ a maka nke a, ha were gwa onye ntaakụkọ a na ha ga-etinye anya na ya. Turkish Airline sị ka enye ha akara ọgụgụ ndị a tọọrọ. BBC mekwara nke ahụ. Otu onye Turkish Airline mechara gwa BBC Igbo na akara ọgụgụ bu nke ha, mana na ọgbụghị ha kagburu ya, na nke a si n'aka ndị ""agent"". Ha gakwara n'ihu gwa BBC na ha agaghị ịgwa BBC aha ""agent"" ahụ, ma kwukwa na ha ka na-eme nyocha ma onwere onye aha ya bụ Maxwell n'ụlọọrụ ha na Lagos. Oluremi Kehinde, bụ onye Naịjirịa bi Rọshịa, na-arịọ ka eme ọsịsọ kpọlọta ndị a tọro na Rọshịa Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ ụkọchukwu Nnamdị Odimegwu na hụ maka uka Christ Embassy na Mosko kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ bịara ikiri iko mbaụwa tọọrọ maka ndị haziri ha akwukwọ ha ji bịa ghọgburu ha. Okwuru na ọ bụ arịro ka a na-arịọ ka akpọla ndị a. ""Onwere ndị nọcha na ọdọ ụgbọelu dị icheiche. Otu onye ahu adịghị ka m na-aga ịhụ ugbua,"" Odimegwu kwuru. ""Ọ bu ndị nọ na Moscow bụ ndị nwere ihu ọmma, ọtụtụ na obodo ndị ọzọ. Anyị na agbali inye aka. Anyi na-enye ha nrị, mana ozughi, makana ọ bụghị ihe anyị ga emeli sọ anyị. ""Ndị nọ Embassy na agbalị, mana aka chọkwara enyemaka,"" Odimegwu kwuru. Ngalaba abụghị nke gọọmentị na Rọshịa akpọrọ Alternativa kwuru na ha enyerela ndị Naịjirịa iri ise aka ịlaghachi mba ha, ma sị na ha che na ndị ihe a metụtara ruru mmadụ 200. ""Ohere na ha adịrị ndị mpu na aghụghọ imegide mmadụ na mbaụwa,"" Yulia Siluyanova, ọnụ na-ekwuru Alternativa kwuru. Siluyanova gwara AFP na ndị gọọmentị Rọshịa, site n'enyemaka Alternativa na-ahazị ka akpọọla mmadụ 20 n'ime ndị a tọọrọ. BBC Igbo gbara mbọ inweta ngalaba na-ahụ maka Naịjirịa na Rọshịa n'ekwentị mana ha azaghị oku anyị kpọrọ ha, maọbụ zaghachị email ezigara ha. Anyi gbakwara mbọ inweta ndị ụlọọru gọọmentị Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53616834,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53616834,Uju Onwudiwe ebola omeiwu ibe ya ebubo iji karama lụsa ya ọgụ n'Imo steeti,Onye omeiwu n'Ụlọmeiwu Imo steeti bụ Samuel Otuibe ekwuola na o nweghị ihe na-esere ya na ogbo ya bụ Uju Onwudiwe dịka ya bụ onye na-anọchite Njaba na-ebo ya ebubo iji karama lụsa ya ọgụ.,"Onwudiwe degara akwụkwọ mkpesa n'ụlọomeiwu steeti nke a gụpụtara n'ọgbakọ ha, ebe ọ rịọrọ ka e nye Otuibe ntaramahụhụ dịka o boro ebubo iji ""karama mmanya na iko mmanya basa ya ọgụ"" . Onwudiwe zigara ndị omeiwu ibe ya akwụkwọ mkpesa ahụ n'ụbọchị Tuzde, kwuru na ọ bụrụ na ndị ụloomeiwu erighi ya iwu n'ime ụbọchị asaa, na ọ ga-ewepụ ya bụ okwu ụlọikpe. Ihe Samuel Otuibe Kwuru Samuel Otuibe bụ onye na-anọchite anya mpaghara Ahiazu Mbaise gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ ndị ụlọomeiwu ga-ekwu ma ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. Kama o kwuru sị ""Ka ọ nọro n'akwụkwọ na enweghị ihe dị etu a mere, Uju bụ nwannem m hụrụ n'anya"". O kwukwara sị ""Uju bụ nwanne m nwaanyị, nwanne na nwanne nwereike ise okwu kama ọ bụghị nke mmadụ ikwu na nwanne ya chọrọ igbu ya"". Ọ kọwara na dịka Onwudiwe werela ya bụ okwu wegara ndị ụlọomeiwu, na ọ dịrị ndị ụlọomeiwu ikwu nke bụ eziokwu. Ihe onyeisi ndị ụlọomeiwu Steeti nke Imo steeti nwere ikwu Emeka Ahaneku bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke onyeisi ndị ụlọomeiwu steeti nke Imo steeti bụ Emeka Chiji Collins, agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu. Ahaneku kọwara na dịka Onwudiwe dere akwụkwọ mkpesa, na ndị ụlọomeiwu ga-etinye anya na ya bụ akwụkwọ dịka usoro ha siri dị. Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ha abụọ na-ekwu ihe dị iche iche, na ụlọomeiwu steeti ahụ ga-enyocha ihe mere n'ezie. Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-52767820,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52767820,Igbo History: Lee aha ndị ochie kpọrọ obodo ha mgbe gboo tupu akpọgharịa ha,Aha obodo bụ njirimara obodo pụrụiche nke ndị obodo ji amacha ma ha zute ndị obodo ọzọ.,"E nwere ọtụtụ usoro obodo ji enwete aha ha, ma nwekwa ihe na-akpata ka obodo gbanwee aha. Mgbanwe aha na-esikwa ụzọ dị iche iche abịa, nke kpatara na-abịa n'ala Igbo, e nwere ụfọdụ obodo aha ha adabachaghị dịka ezigbo aha Igbo si ada. Nke a mere ka BBC Igbo zọpụ njem ka ha mara etu mmiri si banye n'opi ụgbọrọ. BBC Igbo gara mahadum nke Legọs ebe anyị na ọkammụta n'ihe gbasara asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe gbụwara anyị ya bụ akị oyibo nsugbe maka aha ụfọdụ obodo n'ala Igbo. Mazi Chigozie Nnabuihe kwuru na ọ bụ nsupe asụsụ Igbo ka mgbanwe aha ndị a kacha metụte. Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ sị na mkparịta ụka banyere mgbanwe aha obodo: Aha obodo ugbua: Ụmụahịa - Abia steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọma Ahịa Aha obodo ugbua: Owerri - Imo Steeti Aha obodo mgbe ochie: Owe Ere Aha obodo ugbua: Orlụ - Imo steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọlụ Aha obodo ugbua: Awkuzu - Anambra Steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọkụ Ụzụ Etu aha siri bịa: Mkpọru ya n'isi bụ Ọkụ Ụzụ achagbunam, ya pụtara na e jiri ịkpụ ụzụ mara ndị bi n'ala. Aha ha bụ ek Aha obodo ugbua: Okigwe dị n'Imo steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọka Igwe Aha obodo ugbua: Enugu Aha obodo mgbe ochie: Enu Ugwu Etu aha siri bịa: Ọ bụ obodo ndị nọ n'elu ugwu Aha obodo ugbua: Okpaala Ngwa Aha obodo mgbe ochie: Okpu ala Ngwa Aha obodo ugbua: Okpaala - Imo steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọkpụ ala Etu aha siri bịa: Ọkpụ nke a pụtara ala dị ọkpọtọrọọkpụ (Ancient Land) Aha obodo ugbua: Anambra Ihe a bụ otu n'ime fly over dị n'Awka, Anambra steeti Aha obodo mgbe ochie: Ọma Mbala Etu aha siri bịa: Nke a sitere n'aha mmiri Aha obodo ugbua: Port Harcourt dị na Rivers Steeti Aha obodo mgbe ochie: Igwe Ọcha Aha obodo ugbua: Opobo - Rivers steeti Aha obodo mgbe ochie: Igwe Nga Aha obodo ugbua: Bonny - Rivers Steeti Aha obodo mgbe ochie: Ịgbanị Aha obodo ugbua: Oyigbo dị na Rivers steeti Aha obodo mgbe ochie: Obi Igbo Aha obodo ugbua: Abakiliki - Ebonyi steeti Aha obodo mgbe ochie: Abakeleke Aha obodo ugbua: Mbaise - Imo steeti Aha obodo mgbe ochie: Agbaaja, Ahiara, Ekwerazụ, Oke Ovoro na Ezinihite Etu aha siri bịa: Ọ bụ obodo ise nọrọ onwe ha ka ndị ọcha tịkọro ọnụ kpọọ ha mbaise. Ruo taata, ndị Mbaise nwere omenala dị icheiche ha kwenyere na ya. Aha obodo ugbua: Asaba - Delta steeti Aha obodo mgbe ochie: Ahaba Etu aha siri bịa: Ndị Ahaba bụ ndị si obodo nteje n'Anamabra steeti Aha obodo ugbua: Onitsha Aha obodo mgbe ochie: Ọnịcha Aha obodo ugbua: Ibusa - dị na Delta Steeti Aha obodo mgbe ochie: Igbo Ụzọ Etu aha siri bịa: Ndị Ibusa sị Isu nke dị n'Imo steeti ụgbụ a Aha obodo ugbua: Ogwashị Aha obodo mgbe ochie: Ọgwa Ahị Akụkọ na-eso ya: Ndị Ogwashi sitere ala Nri ga-biri ebe ha bi ụgbụ a Nnabuihe kọwara na ọtụtụ aha ndị nwere ""Ọ"" na nsupe ha na ndị ọcha tinyere ya ""AW"". Obodo ndị a gunyere Awka - Ọka, Awkunanaw - Ọkụnanọ, Amawbia- Amaọbịa, Awkuzu-Ọkụ ụzụ na Awgu - Ọgwụ. Nke a bụ maka na nsupe a mere ya ka ọ dịrị ndị ọcha mfe ịkpọpụta. Ugbụ a, ka anyị were ụfọdụ Obodo ndị a kọwara gị etu aha ha siri gbanwee. Ọma Ahịa - Umuahia Tawa n'Umuahia BBC Igbo jụrụ Mazi Timothy Nnochirionye Ohaka, onye bụ onye Umuahịa etu ya bụ aha siri gbanwee. Ohaka kwuru sị "" Ọ bụ mgbe ndị ọcha sị Obodo Bende abata ime Ibeku, ha rutere na-ebe a na-azụ ahịa were jụọ ndị mmadụ aha ebe ha nọ, a sara ha ""Ọma Ahịa"". Kama dịka o siri ha ike ikpọpụta ha kpọọ ya ""Ụmụahịa"". Mazị Ohaka kọwara na-enwere nnukwu ahịa na-azụ karị nke mere eji akpọ ya Ọma Ahịa. Ọ kọwakwara na Ọma Ahịa a dị n'Ibeku ,ma sịkwa na obodo ndị mezuru umuahia ugbua gụnyere Olokoro,Ubakala, Ọhụhụ na Ibeku. Anị Ahaba - Asaba Dịka akwụkwọ mazị Dennis Osadebey dere nke ọ kpọrọ ""Building a Nation"" kọrọ akụkọ ihe mere maka otu nwoke aha ya bụ Nnebisi. Nnebisi bụ nwa nwaanyị Nteje aha ya bụ Diaba onye lụrụ onye Igala aha ya bụ Ojobo. Ọ bụ mgbe a chọrọ ịke ala ka otu onye kparịrị nnebisi were gwa ya na ọ gaghị eketa ala n'ihi na ọ bụghị onye Nteje. Nke a mere ka Nnebisi na ndị na-eso ya siri Nteje pụo were chọwa ala nke ha. Oadebey na-akọwa na njem NNebisi dịka o duru ya site na nsugbe ruo ebe mmiri Ọma Mbala na nke Niger zutere onwe ha. Ọ kọwara na Nnebisi na ndị otu ya gafere mmiri a were rute Ikpele Mmili (Cable Point). Jane Ada: Nwaada Igbo ji ịkpụ ụzụ na-egosi ụwa arụsị e jiri mara ndị Igbo Ha kwụsịri ebe a were sị ka ha kọọ ubi n'ihi n'oge ọrụ ubi ka bidoro. Ihe ha kọrọ mere nke ọma nke mere ka ha birizie ebe ahụ. Nnebisi kpọrọ ebe a Ahaba. Kama Osadebey kọwara na ọ bụ onye Ukọchukwu si mba Itali aha ya bụ Carlo Zappa ma bụrụ kwa onye na-ese maapụ bụ onye dere aha obodo Ahaba dịka Asaba were zịgara ndị ọchịchị. Igboụzọ - Ibusa Obodo a dị na Delta steeti. Asụsụ Igbo ha bụ nke a na-akpọ igbo Enuanị. Lee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo Otu nwaafọ obodo a bụ Patrick Adigwe kọwara BBCIgbo etụ aha obodo ha sị site nha Igbọụzọ gbanwee bụrụ Ibusa. Adigwe kọwara na-enwere akụkọ abụo na-akowa etu aha ha sị malite. Akụko na-akọwa na enwere mmadụ abụọ ndị sị mba ọzọ were bịa n'ala ahụ.. Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo Dịka Dan Olisa Dieyoi sịkwara dee n'akwụkwọ ya, ọ bụ Edini onye sị Nrị bụ ụzọ bịa ala Igbuzo dịka o soro nwanne ya nwoke bụ Ogboli nna ha chụpụrụ ya n'ihi na ọ dịnara otu nwunye nna ya. Onye nke abụọ bụ Umejei bụ nwa Eze ndị Isu ndị obodo chụpụrụ dịka ogburu mmadụ na mgba nke ala Isu n'asọ nsọ. Edini kwụsịrị na Ani-oshe nke dị na Igbụzọ ebe Umejei kwụsịrị na Ani-Nshi Ogboli. Ọ bụ obodo abụọ a bidoro Igbụzọ. Adigwe sị na ""nnanna anyi kwuru na-enwere nghọtaghe maka aha Igbụzọ, ebe ụfọdụ sị na ọ bụ ""Igbo nọ n'ụzọ"" ebe ụfọdụ si na ọ bụ ""Igbo bu ụzọ"". Kama otu ihe pụtara ihe bụ na aha ha bụ ""Igboụzọ"". Dịka o siiri ndị ọcha ike ịkpọpụta ""Igbụzọ"" ha denyere ya dịka ""Ibụsa"" n'akwụkwọ ha na-edenye aha obodo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-45109982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109982,"""Ndị ntorobia nwereike ị họpụta onyeisiala ọhụrụ na 2019"" - Onyeisioche Inec",Onyeisioche Inec ekwuola na ọ bụ ndị ntorobia nwereike ị họpụta onye ga-abụ onyeisiala na ntuliaka 2019.,"O kwuru na nke a ga-eme site n'ọnụọgụgụ ndị bụ ntorobia n'ala Naịjiria ugbua. ""Dịka anyị na-eme ndenye aha maka ntuliaka afọ 2019, ihe anyị hụrụ bụ na ndị ntorobia bụ ndị kachasị n'ọnụọgụgụ ndị denyere aha maka ịtuliaka na 2019"". 2019: E ji Ndigbo eme akaje O kwukwara na n'agbanyeghi na e nwere otu ndọrọndọrọ ruru 68 ugbua, otu ndị ọzọ ruru 130 etinyela aha ịbụrụ otu ndọrọndọrọ nke ha. Yakubu kwukwara na kemgbe ebidoro ị denye aha maka ntuliaka 2019 n'ọnwa eprelu nke 2017, mmadụ ruru nde iri n'otu edenyela aha ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43238447,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43238447,Rwanda: Anyị emechiela ụlọụka 700 maka 'mkpọtụ',Ndị mba Rwanda mechiri ụlọụka ruru narị asaa maka na 'arụsighị ebe ha jiri mere ụlọụka ha ike nakwa na ha na-eme oke mkpọtụ ma ha na-aka ụka'.,"Ndị nọ n'ụlọụka ekpe ekpere Ụfọdụ n'ime ha bụ ụka pentikọstal, kama e mechikwara otu ụlọalakụba. Otu onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na-emepegharịrị ụfọdụ n'ime ụlọụka 700 ahụ ka ndị nyocha kwadochara ya. E tinyekwara iwu ọhụrụ kwuru na ndị mgbasa oziọma niile ga-enweta ọzụzụ mmụta okpukpe tupu ha emepee ụlọụka. Ụfọdụ ụka pentikọstal nke ndị mgbasa oziọma ha na-arụ 'ọrụ ebube', mụbanyere nke ukwuu na mpaghara Afrịka n'ime afọ ole na ole gara aga. Ebe ụfọdụ ụka nwere ọtụtụ ndị ofufe na-arụ ụlọ dị mma, ụfọdụ ndị nke pere mpe na-arụ ụlọ mkpọmkpọ n'anataghị ikike. Ụfọdụ oge, a na-akpụrụ ụlọụka ndị a n'ọnụ maka iji igwe okwu na-eme ka okwu dapụta ụda achọta ndị ofufe ọhụrụ. Justus Kangwagye bụ onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na ihe ha chọrọ bụ ka ụlọụka ndịa mee ihe ndị kwesịrị ekwesị. Kangwagye gwara ndị ntaakụkọ New Times dị na Rwanda n'ụfọdụ ụlọụka ahụ na-etinye ndị otu ha na nsogbu n'ekwesịghị ekwesị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46916035,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46916035,Umahi gbatara anyị ọsọ enyemaka - Ụmụakwụkwọ Ebonyi steeti tọrọ na mba ofesi,Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị gọọmentị Ebonyi steeti zigara obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ etipụla mkpu enyemaka .,"Celestine Nwojiji na ndị ọzọ ekwuola na ọ dịzi ka gọọmentị ha agbalahụla ha n'ala onye ọzọ. Ụmụ akwụkwọ ahụ ruru mmadụ iri abụọ n'ise na-agụ ihe dị icheiche dịka nzere 'PhD, Masters' na ndị ọzọ. ""Ụfọdụ n'ime anyị na-atazị ahụhụ na-arụ ọrụ ọbụla iji hụ nri anyị riri"" bụ ihe o kwuru. Ụmụakwụkwọ Ebonyi Onye enyemaka Gọvanọ Umahi n'ihe gbasara agụmakwụkwọ mahadum bụ Adaeze Nwuzor zara BBC Igbo ajụjụ n'ekwentị. N'okwu ya ""dịka anyị na-ekwu ugbua, okwu ụmụakwụkwọ a dị n'ihu gọvanọ anyị bụ Umahi"" O kwukwara ka ndị ụmụ akwụkwọ ahụ nwee ndidi n'ihi na agụmakwụkwọ bụ ihe dị Umahi mkpa maka na ọ gụrụ akwụkwọ n'onwe ya. Atụmatụ ịkpọpụ ụmụ akwụkwọ ndị si Ebonyi steeti mba ofesi bidoro n'aka Sam Egwu bụbu aka chịburu Ebonyi steeti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" mba-uba-47777522,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-47777522,Nipsey Hussle: Ihe iri mere ọnwụ ya ji ewu,Ụwa niile kpụ Nipsey Hussle n'ọnụ n'ihi ọnwụ mberede zutere ya n'oge ndị oji egbe gbagburu ya n'ụbọchịụka n'ihu ụlọahịa ya dị na Los Angeles mba Amerịka.,"A họpụtara egwu ya dịka egwu kachasị enwe mbem n'ituruugo nke 'Grammy' afọ a. Akụkọ kwuru na a gbara Hussle ọnụ egbe ugboro isii n'ihu ọdọahịa ya. E buru ya gaa n'ụlọọgwụ ebe e kwupụtara na ọ nwụọla. E merụkwara mmadụ abụọ ọzọ ahụ dịka ndị ọrụ nchekwa jiri kwuo. Ọnwụ ya Nipsey Hussle butere oke akpata oyi n'ahụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị ama ama n'iti egwu n'ụwa gọsipụtara nwute ha n'akara Twitter. Rihanna kwuru na mmụọ ya na-ama jijiji n'ihi ọnwụ Nipsey: Pharrell Williams kwuru na Nipsey bụ oke ike kwalitere mmụọ ọtụtụ ndị mmadụ: Miguel kwuru Nipsey nwere ọtụtụ ihe oji n'aka ọ na-arụ tupu ọnwụ ya Onye bụ Nipsey Hussle? Gịnị mere ọnwụ ya jị ewu? 1. Ihe kachasị mee ọnwụ Nipsey ji ewu bụ ebubo ụfọdụ na-ebo n'ọnwụ ya gbasara akụkọ ọ na-akwado ịkọwapụta maka otu nwoke kwuru na ya enwetala ọgwụgwọ ọrịa mminwụ (AIDS). Nwoke ahụ a kpọrọ Dr Sebi nwụrụ n'ụzọ edoghị anya n'ụlọmkpọrọ. 2. Ezigbote aha ya bụ Ermias Davidson Asghedom, a mụrụ ya n'abalị iri na ise ọnwa Ọgọsụtụ afọ 1985. 3. Ọ na-ede ma na-eti egwu, o si n'obodo Los Angeles nke mba Amerịka. 4. Ọ malitere iti egwu na gburu gburu afọ 2000, ebe o tiri egwu ndị dịka 'The Marathon', 'Crenshaw' na ndị ọzọ. 5. A họpụtara egwu ya dịka egwu kachasị enwe mbem n'ituruugo nke 'Grammy' afọ a. 6. Nipsey Hussle mụtara ụmụ abụọ n'aka ụmụnwaanyị abụọ, Lauren London n'afọ 2016 nakwa Emani. 7. A mara Nipsey dịka onye na-achụnta ego, o nwere ebe ọ na-ere akwa a kpọrọ 'Marathon Clothing'. 8. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta Nipsey dịka onye na e nyere ndị mmadụ aka n'obodo ya nakwa ebe ndị ọzọ. 9. Otu onye na ndị na-eche na e gburu Nipsey ,maka ọrụ o ji n'aka ekwuola na ya ga-arụtọpụ ọrụ ahụ 10. Ndị uweojii ji ike achọ onye gburu Nipsey. Mana nkọwa ndị uweojii na onye ha na-achọ bụ 'nwoke isii ojii' were ọtụtụ iwe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52619012,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52619012,Kedụ ihe bụ 'almajiri' na-etu mmadụ na-esi abụ ya?,Otu aha na-ewu ugbua bụ 'almajiri' dịka akụkọ na-efegharị maka ha n'ọwụwa-anyanwụ nakwa ebe ọzọ.,"A na-eche na ihe butere akụkọ maka almajiri bụ dịka aka na-achị steeti ndị dị n'ugwu kagburu atụmatụ almajiri ma nwee nkwekọrịta na ha ga-amalite ịkpọla ndị almajiri ebe ha si. Ọzọkwa bụ na a na-ejide ụgbọala bu mmadụ n'agbanyeghi na gọọmentị kagburu ibu mmadụ n'okeala steeti dị iche iche. Ihe abụọ a nwereike bụrụ ihe e ji eme okwu na-eyi ndị mmadụ egwu nke aha almajiri nọ n'etiti ya. Mana, okwu almajiri edoghi ndị ọwụwa-anyanwụ na ndị ndịda Naịjirịa ndị ọzọ anya makana ọ bụghị ihe njirimara na be ha. Nke a butere anyị n'ajụjụ a bụ ""kedụ ndị bụdị ndị a na-akpọ almajiri?"" Ihe bụ Almajiri Etu ọbụla e si kwuo ya, ihe mbụ ị kwesịrị ịma maka almajiri bụ na ha bụ ụmụakwụkwọ. Ndị almajiri bụ ụmụaka nne na nna ha kpọgara ụlọakwụkwọ ebe ha ga-anọ mụọ maka ofufe alakụba. Ịma atụ ya ga-abụ ụmụaka na-aga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ obibi nke Bekee na-akpọ ""boarding school"". Ihe dịkwa iche n'atụmatụ ụlọakwụkwọ obibi nke Bekee na nke almajiri bụ na ebe a na-enye ndị nke Bekee nri na ọzụzụ purụiche, ndị nke almajiri bụ ihe ha rịọtara n'arịriọ ka ha na-eri. Ọzọ bụkwa na ebe ndị nke ụlọakwụkwọ Bekee na-amụ ihe ọmụmụ dị iche iche, ndị almajiri na-amụ sọsọ ihe banyere ofufe alakụba. Kedụ etu almajiri a siri malite? Almajiri nwetere aha ha site n'asụsụ ndị Arab. Ọ bụ ihe ndị a na-akpọ ""Al muhajirun"", bụ nke pụtara onye na-aga njem maka ịmụta ofufe Alakụba. Nke pụtara na ụmụaka a nọ n'ije ọmụmụ. Ndị ma maka akụkọ a na-ekwu na tupu Bekee abata ebe a na-akpọzị Naịjirịa, ndị almajiri anaghị ebu efere akpagharị makana ndị na-achị obodo haziri ụlọakwụkwọ ha ọfụma. Mana ka a bịara napụchaa ndị ọchịchị mgbe ahụ ikike ha, ihe niile mebichara nke mere na ụmụaka gara ọmụmụ a na-abụzị ndị ọ dịịrị ịchọta ihe ha ga-eri kwa ụbọchị. Ha na-eme nke a site n'ịrịọ arịrịọ. Dịka ụfọdụ alakụba na-akwado onyinye, nne na nna na-ezipu ụmụ ha ịga ije a na-enwekarị olileanya na ha ga-enweta enyemaka. Na mbụ, ọ bụ usoro a bụ usoro mmụta akwụkwọ dị n'ugwu Naịjirịa na-ebe ọzọ tupu e nwee mmụta akwụkwọ Bekee. N'oge ahụ, a na-enwe ndị na-elekọta ụlọakwụkwọ ndị a nke eze mpaghara ha hibere. Ugbua, o bụzị oke na onwe ya chụwa ngwere. Afọ ole ka ndị almajiri na-adị? Ndị a bụ ụmụaka site n'oge amamihe ruo okoroọbịa. Ndị dị ka nna nna ide ego Aliko Dangote bụ Alhassan Dantata, gabigakwara atụmatụ a ma ruo oge ọ dị afọ iri asaa. Ọ bụ ohere a na-enye ka ndị almajiri na-amụtakwa ihe ọzọ oge ha anaghị amụ ọmụmụ alakụba mere nwoke a jiri mụta mgbere ma bụrụ ide kachasi nwee ego n'ọdịda anyanwu Afrịka mgbe ochie. Ugbua, nwa nwa ya bụ Aliko Dangote bụ ide kachasị nwee ego n'Afrịka, mana yanwa esoghi n'usoro almajiri na ịmata izu nke ya. Foto a na-egosi ụmụakwụkwụ almajiri azọpụtara n'otu ụlọakwụkwọ Alakụba dị na Kaduna steeti n'afọ 2019 Ihe mere eji kagbuo atụmatụ a? Dịka anyị dere ebe a mbụ, atụmatụ almajiri gbanwere n'oge ndị Bekee malitere ịchị ebe mechara bụrụ Naịjirịa. Ka oge na-aga, ọtụtụ mmadụ malitere ịgbarụ ihu maka ọnọdụ ụmụaka a nakwa ụdịrị ahụhụ ha na-ata. Nke a kpatara ndị mmadụ jiri na-asị ka akagbuo ya bụ atụmatụ. Ọzọkwa bụ na usoro ya adabaghị n'usoro akwụkwọ Bekee. N'oge ọchịchi ya, Goodluck Jonathan gbara mbọ ịrụpụta ụlọakwụkwọ ebe ndị almajiri na ụmụ ndị ọchị ehi anaghị anọ otu ebe ga na-aga akwụkwọ. N'ịkagbụ atụmatụ a, gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna steeti kwuru sị na ọ bụ ọnọdụ coronavirus tinyere ụwa mere o jiri dịrị ha mfe. Ọ sị; ""ma ya abụghị coronavirus, anyị agaghị ahụnwu ụmụaka n'otu ebe. Ọzọkwa bụ na coronavirus mere ka ndị mmadụ kwụsị ịpụta n'ezi, bụ ihe mere ụmụ na-eri oge ha hụrụ banye n'ezigbote ahụhụ nke mere o jiri dị mkpa ịkpọla ha. ""Ọ bụ coronavirus nyere anyị ohere ịkagbu atụmatụ a."" Gọvanọ El-Rufai sị na ụmụaka ga-amalite akwụkwọ Bekee ma ụlọakwukwọ mepee. Mana, ọ sịkwa na ọ bu etu o si metụta steeti Kaduna ka ọ na-ekwu maka ya. Ndị gọọmentị steeti ndị dị n'Ugwu Awụsa a na-akpọbata ndị Almajiri n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa? Onweghị ihe ọbụla BBC hụrụ ga-egosi na eziokwu dị n'ọtụtụ akụkọ na-efegharị na aka na-achị steeti ndị dị n'Ugwu Awụsa na-etinye ndị almajiri n'ụgbọala akpọsa ha n'ebe dị iche iche na Naịjirịa. Nke BBC ma bụ eziokwu bụ na ọgbakọ steeti ndị Ugwu Naịjirịa nwere nkwekọrịta na ha ga-akpọla ụmụakwụkwọ almajiri nọ steeti ha be nne na nna ha. Nke mere ha jiri kwekọrịta na steeti ọbụla ga-enweta ndị nke si steeti ha. Dịka aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai siri kwuo ""Anyị na ahanye ụmụaka n'aka gọọmentị steeti ha. Ebe ahụ ha eruo nso nne na nna ha. Nkwekọrịta anyị bụ na gọọmentị ọbụla ga-ama oge ndị nke ha na-alọta. N'otu aka ahụ, ọ ga-abụ ndị gọọmentị ga-akpọlata ha"". A nwụchiri ụgbọala bu ndị mmadụ si Ugwu abata Legọs n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee Kedụ etu okwu coronavirus siri metụta ndị Almajiri Dịka e dere n'elu, ọ bụ okwu coronavirus soro kwanye imechi ụlọakwụkwọ almajiri nakwa ịkpọla ha be a. Ọnọdụ ha nke gụnyere ịrịọ arịriọ nakwa iri ihe ndị mmadụ riforo mere ka ha nọdụ n'ime ndị ọrịa na-efesa kwam kwam. Ọ bụ aka na-achị Kaduna bụ El-Rufai kwuputere na ọkankụ ndị ahụrụ ọrịa coronavirus n'ahụ na steeti ha bụ ndị almajiri e si steeti Kano kpọlata. Mana ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ dịghị etu a n'etiti ndị nke e si steeti ndị ọzọ kpọlata. Etu ọbụla o sina dị, akwụkwọ almajiri alaala na Naịjirịa mana okwu maka ya ka ga na-agakwa n'ihu." egwuregwu-44550182,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44550182,World Cup 2018: Lee mmadụ ise riterela 'Golden Boot' n' Iko Mbaụwa ise,Nturuugo 'Golden Boot' bụ nke a na-enye ndị kachasị nyeta goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị FIFA na- ahazi.,"bụ nke a na-enye ndị kachasị nyeta goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị FIFA na aghazi. A na-ahazi ndị kachasị nye goolu n'ogogo n'asọmpi Iko Mbaụwa ọbụla a na-agba. A malitere na-enye nturuugo a n'afọ 1982 n'aha akpụkpọ ụkwụ ọlaedo(Golden Shoe) mana agbanwere aha ya kpọọ ya, 'Golden Boot' n'afọ 2010. Ọ bụrụ na-enwe ihe ruru mmadụ abụọ nwere otu ọnụ ọgụgụ goolu, a ga-enyocha enyemaka ha nyere na goolu ndị ọzọ ma họrọ onye kachasị nye aka. Mana kemgbe afọ 2006 a na-enye ya onye nke kachasị nwee ohere nta n'ịgba asọmpi n'afọ ahụ. Ndị riterela 'Golden Boot' n'oge ise nke asọmpi Iko Mbaụwa gụnyere ndị a; Davor Suker: O ritere nturuugo buut ọlaedo n'asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1998 nke a gbara na mba Fransị. Davor Suker bụ nwafọ mba Kroeshịa. O ritere nturuugo buut ọlaedo n'asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1998 nke a gbara na mba Fransị. Suker nyere goolu isii iji nwete ihe nturuugo buut ọlaedo. Kroeshịa gbara ndị atọ ebe Fransị gara n'ihu maburu Iko Mbaụwa ahụ. Ronaldo Luis Nazario de Lima: Ronaldo bụ nwafọ Brazil, ọ ritere buut ọlaedo ya n'Iko Mbaụwa Saụt Korịa/Japan afọ 2002. Ronaldo bụ nwafọ Brazil, ọ ritere buut ọlaedo ya n'Iko Mbaụwa Saụt Korịa/Japan afọ 2002. O nyere ọkpụ goolu asatọ n'oge asọmpi ahụ niile dịka o nyere goolu n'agba ikpeazụ. Brazil meriri Jamịnị iji mabute Iko Mbaụwa nke afọ 2002. Miroslav Klose: Nwafọ mba Jamịnị bụ Miroslav Klose ritere nke ya na mba ha bụ Jamịnị n'Iko Mbaụwa 2006. Nwafọ mba Jamịnị bụ Miroslav Klose ritere nke ya na mba ha bụ Jamịnị n'Iko Mbaụwa 2006. Klose nyetere ọkpụ goolu ise n'agbanye ha gbara ndị nke atọ. Mba Itili gara n'ihu mabute Iko Mbaụwa nke afọ ahụ. Thomas Muller: Thomas Muller bụ nwafọ mba Jamịnị nyere goolu ise iji rite buut ọlaedo ebe Jamịnị gbara ndị atọ. N'asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2010 na Saụt Afrịka ka a gụrụ ya aha 'Buut Ọlaedo' ebe. Thomas Muller bụ nwafọ mba Jamịnị nyere goolu ise iji rite buut ọlaedo ebe Jamịnị gbara ndị atọ. Mba Spen maburu Iko Mbaụwa ahụ nke afọ a bụ ha mbụ ịmabute ya. James Rodriguez: James Rodriguez bụ nwafọ mba Kolombia ritere buut ọlaedo nke ya n'afọ 2014 n'Iko Mbaụwa a gbara na Brazil. James Rodriguez bụ nwafọ mba Kolombia ritere buut ọlaedo nke ya n'afọ 2014 n'Iko Mbaụwa a gbara na Brazil. Rodriguez nyere ọkpụ goolu isii n'Iko Mbaụwa ahụ na Brazil ebe Brazil gbapụrụ ha n'agba anọ ikpeazụ. Mba Jamịnị mechara buru Iko Mbaụwa ahụ mgbe ha meriri Ajentina n'ikpeazụ. Rọshịa 2018: Super Eagles nọ n'otu kachasi ike" egwuregwu-44615287,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44615287,World Cup 2018: Ụmụ Naịjirịa ebee ka a gbaturu ugo Naịjirịa,Omume ụmụ Naịjirịa bụ egwu agwara ọgwa n'asọmpi ha gbara taa megide Ajentina ebe Ajentina gbara ha ọkpụ goolu abụọ asatara otu.,"Ebe ọnọdụ a bụ ihe mwute nye ọtụtụ, ụfọdụ ndị tinyere ego ha ebe Ajentina nọ na-amịcha aka. Ụfọdụ gara na soshal midia ikwupụta etu obi dị ha gbasara asọmpi a. Caristo Clear kwuru na ego ya dị n'Ajentina ebe obi ya dị n'ebe ndị Naịjirịa nọ. End of Twitter post, 1 Mana The only Edward na-eru uju maka na ego ya alaala ka o tinyechara puku iri n'ebe Naịjirịa nọ. Onye egwu a ma ama bụ Kizz Daniel kwuru na anyị ga-ekele Chukwu n'ihe niile n'ikpeazụ. Nke a bụ n'agbanyeghi na Kizz Daniel kwuru na obi gbawara ya nke ukwuu. Jesse Onemic kwuru na obi mwute ya na-enweta ụfụ asọmpi a na-afụ ya. N'akụkụ nke ya, Tweet Oracle kwuru na onye nkuzi ndị bọọlụ Naịjirịa bụ Gernot Rohr ahọpụtaghị ndị ọ kpọ gaa agha bọọlụ a nke ọma. Otu ihe dị mkpa bụ na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na-ele anya na ndị Super Eagles kara imeri asọmpi a ka ha jiri ya hichaa ụmụ Naịjirịa anyammiri ọbara niile kwafuru n'izuụka gara aga. A na-ele anya na ndị Super Eagles ga-alọta maka na a gbapụla ha n'asọmpi Iko mbaụwa afọ 2018. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45511888,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45511888,Buhari: Ihe mere aha Yusuf Magaji Bichi onyeisi DSS ọhụrụ ji ewu,"Onyeisiala Muhammadụ Buhari họpụtara Yusuf Magaji Bichi dịka onyeisi ọhụrụ ndị DSS, ọtụ nchekwa nzuzo nke gọọmenti etiti ụbọchị Tọọsde.","End of Twitter post, 1 Mana obi ụmụ Naijiria na-asụ ka mmiri ọkụ n'ihi nke a. Ọtụtụ ha na-ebo Onyeisiala ebubo ịkpa oke agbụrụ n'ihi na nwoke ahụ nochiri Seifa bụ onye Ugwu Awụsa. End of Twitter post, 2 Ụfọdụ dịka @ChidiOdinkalu, otu onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye na-atụ uche na Daura a chụrụ n'ọrụ ga-na-ekwu ihe ga na-eme na DSS dịka onye ọhụrụ bụ nwa ọrụ ya. Mana ụfọdụ na-ekwu na Buhari emeghị ihe ọjọọ ọbụla Cheta n'ụbọchị Tọọọ̀de, ọnụ na-ekwuru onyesiala Naịjirịa bụ Garba Shehu depụtara nke a n'akara twitter ya na Bichi bụ onye ọrụ nchekwa nke ọma. Onye ka Yusuf Magaji Bichi bụ? Bichi bụ onye gaburu ezumike nke n'ọrụ DSS n'afọ 2017 gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Kano Steeti. Ọ gụrụ ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria. Onyeisi ọhụrụ a bidoro ọrụ ya n'ụlọọrụ nchekwa dị na Kano Steeti ebe o mechara rụwara ụlọọrụ ncheckwa akpọrọ Nigerian Security Organization (NSO). A zụọla ya n'ihe gbasara ọrụ nchekwa na mba ofesi. Shehu depụtakwara na Bichi na-enweta oke amamihe n'ihe gbasara ọrụ nchekwa, akọnauche, nyocha nakwa ị họpụta ndị ma ọrụ nchekwa n'ọkwa a ọ nabata na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48556563,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48556563,Kelechi Iheanacho: Egwu erughi ya ụkwụ n'Afcon 2019,Otu na-ahazị egwu bọọlụ na Naịjrirịa bụ Nigeria Football Federation ewepụtala aha ndị ga-anọchite anya ndị Naịjirịa na asọmpị TotalAfcon 2019 a ga-agba na Ijipt ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun.,"Aha ndị ga-aga Afcon2019 agbaala ka okwe Aha Kelechi Iheancho esoghị na ya bụ akwụkwọ NFF depụtara na ọbaozi Twitter. Aka ndị uweojii akparala ndi FRSC n'Onitsha Aka ndị uweojii n'Anambra steeti akpara ndị ọrụ Road Safety n'Onitsha maka ịtọgbụ onye otu ha aha ya bụ Emeka Ojei. Akụkọ anyị nụrụ kwuru na Ojei kpọrọ ekwo nkụ ịfụ opi megide mpụ na ngarị ọ sị na mmadụ abụọ ahụ mere. PHCN akwadoolaịgba gọmentị akwụkwọ Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa Ụnụ anụla e na ndị ọrụ Power Holding Company nke Nigeria mechiri emechi agbakwurula onye okikpe maka ịgba ụlọọrụ Bureau for Public Enterprise akwụkwọ. Onyeisi ndị otu a bụ Malam Hassan Gar gwara ndị ntaakụkọ na Bauchi taa na ndị otu ha ejikerela ịgba gọmenti akwụkwọ maka ụgwọ eji ha. Ngagharịiwe na Hong Kong N'ofesi e, ngagharịiwe na-aga n'ihu ugbua na Honk Kong igbochi gọmentị ime iwu maka ịkpe ndị mmadụ ikpe na China karịa na Hong Kong bụ ebe ha bi. Ndị Hong Kong na-atụ egwu iwu a ga-enye ohere ka China wee ike megide ndị ọchịchị na-amasịghị ha. Akụkọ maka ịtụbata ahịa na Naịjirịa Godwin Emefiele Onyeisi ụlọakụ etiti na NaỊjirịa bụ Godwin Emefiele ekwuola na mmadụ ọbụla maọbụ ụlọọrụ ọbụla ejidere na-ezobata ngwa ahịa na Naịjirịa ga-atakụta ya kọnkịrị O kwuru na a ga-amachi ọbaego ndị ahụ iji kpaji ha nku n'ihi na nzobata ngwa ahịa so n'ihe na-eme na usoro ịwulite akụnaụba Naịjirịa ejighi amịta mkpụrụ. Gọọmentị Nassarawa nọ na mmiri ọkụ Otu ụlọikpe na Nassarawa agwaala gọọmentị steeti ahụ ha kwụghachi ụlọ mgbasaozi Breeze Fm ihe ruru nde naira iri isii n'ọma maka ụlọọrụ ha akwaturu n'afọ 2017. Okaikpe Rose Soji nyere ikpe kwuru na atụmatụ gọọmentị ahụ megidere akwụkwọ iwu Naịjirịa ma kwuo na ha ga-arịọ Breeze Fm mgbaghara n'ihu ọha. Na mba Sudan, Otu jịkọtara ndị ọchịchị onyekwuouche ya akpọọla oku ka ndị mmadụ ghara iwu debere ala ahụ dịka mmadụ karịrị iri atọ na-eme ngaghrị iwe nwụrụ n'aka ndịagha ala ahụ. Cheta na ọgbakọ mba Afrịka bụ AU mapụrụ mba Sudan n'etiti ha rue mgbe ha ga-etinye onyeisiala ziri ezi. N'egwuregwu, Onye nchịkọta otu Super Falcons bụ Thomas Denerby agwaala ndị mmadụ ha adana mba n'okwukwe ha nwere n'otu Naịjirịa. Denerby kwuru nke a n'agbanyeghi na mba Norway jị ọkpụ atọ asataghị otu merie ha n'asọmpị mbụ ha na njem iko mba ụwa ụmụnwaanyị. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Ụmụ Obiligbo: Anyị ejeghị nga na mba ofesi, ọ bụ asịrị" afirika-45231529,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45231529,"Kofi Annan, onye bụbu odeakwụkwọ UN anwụọla","Kofi Annan, onye bụbu onye odeakwụkwọ ukwu otu mbaụwa a kpọrọ United Nations(UN) anwụọla.","Kofi Annan bụ onye isiojii Afrịka mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi otu UN Ọ nwụrụ na mba Swizaland n'ụtụtụ taa bụ Satọde. Annan onye bụ onye mba Ghana rụrụ ọrụ dịka odeakwụkwọ ukwu UN nke asaa bido n'ọnwa Janụwarị afọ 1997 rue Disemba afọ 2006. Annan bụ onye isiojii Afrịka mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi otu UN. Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa dịka onyeisi UN ka okwu Agha Iraq nakwa nsogbu HIV/AIDS kpụ ọkụ n'ọnụ. Annan mechara ruọ ọrụ dịka onye nnọchite UN na mba Syria, ebe ọ gbara mbọ maka iweta udo na mpaghara ahụ. Annan bụ lụburu onye Naijiria aha ya bụ Titi Alakịja, ha gbasara n'afọ 1983, ọ lụọ Nane. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Annan N'akwụkwọ ozi onyeisi UN ugbua bụ António Guterres wepụtara, O kwuru na Annan bụ 'aka na-agbazi.' ""O nyere mmadụ niile,ebe niile ohere mkparịtaụka, ebe igbo mkpa na ụzọ gana-eduga ụwa ka mma."" Guterres kasiri nwunye ya bụ Nane Annan, ezinaụlọ ya nakwa ndị na-ebe akwa ọnwụ nwa Afrịca bụrụ ọkpa udo na mbaụwa."" Iji kwanyere Annan ugwu, onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo enyela iwu ka ewtuo ọkọlotọ ala ha ebe niile n'ala ha n'ụlọ ọrụ nnochiteanya ha na mba ndị ọzọ otu izuụka bido n'ụbọchị Monde, Ọgọstụ 20, 2018. Osote mịnịsta mba Ghana na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Charles Owiredu gwara BBC n'ihe ahụ mere n'ezie sị na ọbụ ihe mwute na dike e ji eje mba dịka Kofi Annan ala mụọ. Onyeisi mba Briten bụ Theresa may kwuru na ọ bụ ""ihe mwute ịnụ maka ọnwụ Kofi Annan. May kpọrọ ya, 'nnukwu onye ndu' na 'onye hazigharịrị UN' nke nyere aka ị mee ka ụwa dị mma ka ọ dị mgbe a mụrụ ya. Emmanuel Macron bụ onyeisiala mba Frasi kwuru na ihe o depụtara n'igwe okwu Twitter ya n'asụsụ Frenchị sị na Fransi na-akwanyere Annan ugwu. Macron sịrị na ha agaghị echefu ihu ya na-edere jụụ nakwa ike ọgụ ya. Ụbọchị dị mkpa na ndụ Kofi Annan Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43806199,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43806199,Falae: Atara m onwe m ụta maka ikwado Buhari,Onyeisioche otu SDP bụ Olu Falae emeela ngaramara maka nkwado o nyere onyeisiala Muhammadụ Buhari iji banye n'ọkwa ọchịchị na ntuliaka afọ 2015.,"Obi adịghị Olu Falae, onye ndị ọchịehi wakporo ugbo ya ugboro ugboro mma Falae kwuputara nke a oge ya na onye bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo, nwechara ọgbakọ n'ọbakwụkwọ ya dị n'Abeokuta ụbọchị Tuusde. O kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala. ""Okwu ihe gbasara Naijiria karịrị agụrụ ịnọ n'ọkwa ọchịchị nke onye ọbụla."" O kwu kwara sị ""gọọmenti etiti maara, mụ onwe m makwara na ha emeghị nke ọma. Ihe kacha mkpa n'ọrụ ha bụ ichekwa ndụ ndị a na-achị mana gọọmenti a anaghị eme ya. ""A na-egbusi ndị mmadụ kwa ụbọchị, gọọmenti ọbụla enweghị ike ịkwụsị ya, adaala. ""Onyeisiala Buharị bụ enyi. Ọ bụrụ na unu cheta, E weliri m ya aka elu na Adamasingba Stadium dị n'Ibadan rịọ ndị mmadụ ka ha tụnyere ya n'ihi na anyị chere na ọ ga-ahazigharị Najirịa. ""Mana eziokwu bụ na o meghị ọfụma. Ana m enwe olileanya na dịka onye eziokwu na onye na-eche ezi echiche, na ọ ga-ele anya etu ihe si aga, na ọnọdụ ahụike ya, ma sị na ya agaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ."" ""Otu ihe m ji aka bụ na ọtụtụ ndị jịkọrọ aka chọọ mgbanwe maka ọdịmma na ime ihe ọbụla ga-ekwe omume iji wepụ Muhammadu Buhari maka ọdịmma onwe ya na ọdịmma ndị Naijiria niile."" Akụkọ ga-amasị gị: Dịka o siri gbasa otu ahụ pụtara ọhụrụ nke ọbasanjọ nọ n'isi ya, Falae kwuru sị: ""Eji m n'aka na ọ bụrụ na ndị Naijiria niile na-eche ezi echiche ga-ahụ mkpa ọ dị iji gbakọọ aka hụ na e nwere ezi mgbanwe, mgbanwe bara uru, mgbanwe maka ọganihu ga-eme n'afọ 2019. Anyị niile chọrọ mgbanwe site n'oke enweghị ọrụ, mkpagbu na ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ, mgbanwe site n'iyiegwu ndị Boko Haram na ọnọdụ ndị mmadụ ịna-atụ egwu ịga n'ugbo ha, mgbanwe site n'obi mgharipụ na iwelite akụnaụba ala anyị."" Falae bụ odeakwụkwọ nke gọọmentị (SFG) n'ọge ọchịchị Ibrahim Babangida. Ọ rụkwara dịka odeakwụkwọ ukwu (Permanent Secretary) n'oge ọchịchị Olusegun Ọbasanjo dịka onyeagha site n'afọ 1977 ruo 1979." afirika-54024071,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54024071,Frank Ibezim: E duola ya n'iyi ọrụ dịka onye nnọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu ukwu,Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmad Lawan eduola Chukwuma Frank Ibezim n'iyi ọrụ dịka onye omeiwu na-anọchite anya Imo Nọt n'ụlọomeiwu ukwu.,"Ibrahim El-Ladan bụ oje ozi nke ụlọomeiwu ukwu ka Lawan nyere iwu ka o duo ya n'iyi ọrụ. Ka ọ na-edu Ibezim n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tuzde, 27 nke ọnwa Epreelụ 2021, Lawan kwuru sị ""Site n'ịṅụ iyi ọrụ a, anọchitela Imo Nọt anya ọfụma."" Cheta na Ibezim na Ifeanyi Araraume bu okwu gbasara onye meriri na ya bụ ntuliaka gaa ụlọikpe mgbe e mechara ntuliaka n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2020, maka oche ahụ. Ndị 'Ben Johnson' agaghị eso zọọ ọkwa Senator Imo North - FCC Jones Onwuasoanya Onwuasoanya FCC Jones onye na-ekwu na ọ bụ ya bụ onye mgbasa ozi APC n'Imo steeti, ka na-ekwusi ike na ọ bụ Ararume meriri ya bụ ntuliaka. O kwuru na ọ bụ n'Owere ka ụfọdụ ndị nọrọ gbaa izu ma kpọpụta aha Frank Ibezim dịka onye meriri ntuliaka ahụ. Mpụtara nke a na-egosi na ọ bụ Ifeanyi Ararume meriri, mana ndị isi APC n'Imo steeti sị na ọbụghị eziokwu Onwuasoanya dọkwara aka na ntị ka ndị isi APC nọ n'Abuja nakwa Inec kpachapụ anya ma ghara iwepụta Frank Ibezim ka ọ nọchite anya ndị APC na ntụliaka ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na dịka Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na ya si ụzọ 'Ben Johnson' bata n'ọchịchị, na ha agaghị ekwe ka o mee otu a ọzọ. Okwu nke a na-abịa dịka ndị isi otu APC n'Abuja nakwa Inec kpọpụtara aha Frank Ibezim dịka onye meriri. Onwuasoanya FCC Jones kwuru na ọ bụ ya bụ ọnụ na-ekwuru APC n'Imo steeti Enyinna Onuegbu, onye sokwa na ndị isi APC n'Imo steeti, gwaburu BBC Igbo n'ekwentị na FCC Jones bụ onye ọchọnganoko. O kwuru sị: ""Onye meriri ntuliaka ime ụlọ anyị mere n'Imo North bụ Frank Ibezim."" ""Ọ bụ ya ka ndị isi pati anyị nọ n'Abuja ma."" Onuegbu kwukwara na akwụkwọ ahụ na-egosi aha Ararume dịka onye meriri ya bụ ntuliaka bụ okpotokpo asị. Benjamin Uwajumogu bụ onye nọchiburu anya ndị imo North n'ụlọ omeiwu Sineti, mana ọ laala mmụọ. Oche ndị Imo North n'ụlọ omeiwu ukwu ghe oghe ugbua n'ihi na Benjamin Uwajumogu onye nọbụ na ya alaala mmụọ. Ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' kwuru na ọ bụ na abalị ikpeazụ nke ọnwa Ọụtoba ka ha ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ọhụrụ. Pati ndị ọzọ a ma ama emekwaala nhọpụta nke imeụlọ ma wepụta ndị ga-anọchị anya ha na ya bụ ntuliaka. Dịka akụkọ si kwuo, otu 'Peoples Democratic Party' họpụtara Mazị Patrick Ndubueze onye okpuruọchịchị Okigwe, ebe ndị 'All Progressives Grand Alliance' họpụtara Mazi Charles Onyirimba onye okpuruọchịchị Ehime Mbano." afirika-46728982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46728982,2019 Prophecies for Nigeria: Ihe ndị ụkọchụkwụ kwuru maka etu afọ 2019 ga-esi adị,Ụkọchukwu na ewu ewu bụ Reverened Father Ejike Mbaka ekwuola na ọchịchị Buhari na-agbalị n'ihe gbasara ịrụ ụzọ nakwa inye ndị ọrụ ugbo ego mgbazinye eji arụ ọrụ.,"O kwuru nkea mgbe ọ na-aka ụka iji nabata afọ ọhụrụ 2019 n'Adoration, Umuchigbo Iji Nike Enugwu. Father kwuru na ya amaghị onye ga emeri na ntuli aka na-ahịa na 2019 ma kwuo na ya echeghị n'Atiku bụ onye nzọpụta Nijiria. Onyere Buhari ndụmọdụ na ọbụrụ na ọ ga eye ntị chụpụsịa ndị ajọ mmadụ gbara ya gburu gburu na emebiri ya ihe, na gọmenti ya ga adị mma. Ụfọdụ ụmụ Naijiria akatọọla ndị ụkọchụkwụ burula amụma maka ihe ga-eme n'afọ 2019. Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" Dịka afọ 2019 malitere ụbọchị Tuzde, ọtụtụ ndị ụkọchukwu a maara aha ha ezipụtala ozi afọ ọhụrụ ha, iji nye ndị mmadụ ntụzi aka gbasara afọ a. Mana ụfọdụ Ndị Naijiria kwuru na ha na-akụsasị ụmụ mmadụ anya n'ihi n'amụma Okeke buru dị iche na nke Okafor buru. Ụfọdụ kwuru n'okpu Mbaka kpọrọ ka akwado Buhari bụ mere mere n'ihu gwọmpụtụ n'azụ. Ihe Mbaka kwuru N'okwu Chukwu ya na mmemme iji banye afọ ọhụrụ, onyeisi na-elekọta Adoration Ministry Enugu Nigeria, bụ Fada Ejike Mbaka, buru amụma na afọ ọhụrụ a ga-ewetara ọtụtụ ụmụnwaanyị ihu ọchị. O kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị aga ga-ekuru ejima abụọ na atọ na afọ a. O kwukwara na afọ a ga-abụ oge mgbanwe tọrọ atọ nye ndụ ndị Naijiria. Ihe ọzọ gbara elu dịka o siri kwuo bụ na ọtụtụ ndị ogbenye na ndị opekatampe ka aga-eburu ike n'ikikere ọchịchị ụlọọrụ nakwa n'ọchịchị obodo tinye n'aka. Ihe Oyedepo kwuru: N'okwu afọ ọhụrụ ya, onyeisi ụlọụka Living Faith Church, nke e jikwa Winners Chapel mara, bụ David Oyedepo, kwuru na afọ a, anyị ga-abụ ọkaibe n'ime ihe niile anyị n'eme. Enoch Adeboye Onye a bụ onyeisi ụlọuka Redeemed Christian Church of God, kpara ndị ụlọụka ya ọchị mgbe o kwuru na ọma na ọtụtụ ndị mmadụ n'eche ya ka okwu o okwu gbasara ntụliaka aga eme n'ala anyi na-afọ a. Ọ gaziri n'ihu gwazie ndị ala anyi ka ha gaa n'ime akwụkwọ nsọ (Abụ akwa 3:22-23) iji mara ihe chineke n'ekwu maka obodo anyị. Okey Ifionu Ụkọchukwu na-elekọta Emmanuel Anglican Church, Railway Compound dị na Lagos, kwupụtara na-ewepụtala afọ a dịka mgbe ndị otu Kraisti ga-agbasa oziọma Kraistị na mbaụwa niile iji were rita mkpụrụobi. Ọ gbadoro ụkwụ mkpebi a n'Akwụkwọ Ilu 11:30. Paul Chikwem Ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka Christian Penticostal Mission dị na Festac, Legos kwuru na afọ 2019 bụ afọ Chukwu ga-akwụ ụmụ ya ụgwọ ọrụ nke ukwuu. Nkpebi a gbadoro ụkwụ na akwụkwọ Genesis (15:1). Chikwem buru amụma na ụmụ Chukwu ga-enweta ụgwọ ọrụ pụrụiche site n'ịhụọma nke Chukwu na-enye(Abụọma 44:3). ""Aka nchekwa na nweta nke Chukwu ga-enye ụmụ Chukwu ezumike n'afọ 2019""(Exodus 33:14). Paul Adefarasin Onye ụkọchukwu a bụ onyeisi ụlọụka a kpọrọ ""House on the Rock"" kwuru na afọ 2019 ga-abụ afọ aha ụmụ Chineke ga-ada ụda na mba ụwa niile ma nwetakwa ọtụtụ ohere ime ihe ịrịbama n'afọ a. Ihe Johnson Suleiman Ahụrụ m Igbo dika onyeisiala n'afọ 2023 mana ha ga-agba mbọ na ha enweghị nkwekọrịta na gọmenti ugbua. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54869179,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54869179,"Ngwa nri, mmanụ ụgbọala, ọkụ latrik na ihe ndị ọzọ ọnụego ha rịrị elu ọrji na 2020","Igbo tụrụ ilu sị na mberede nyịrị dike,na mberede ka e ji ama dike. Mana ọ dị ka a ga-asị na ihe mberede mere n'afọ 2020 nyịrị dike n'ezie.","Ihe mberede ndị dịka ọrịa coronavirus, ọgbaghara ngagharịiwe End SARS na ihe ndi dakwasịrị ụwa ọkachasi Naịjirịa gbanwere ọtụtụ ihe dị iche iche. Otu n'ime ihe ndị gbanwere bụ mbuli n'ọnụ ego ụfọdụ ngwa ndị e ji ebi ndụ na Naịjirịa. Akụkọ a ga-atụle ụfọdụ ihe ndị ọnụ ego ya rịrị elu, ihe kpatara ya na etu o si metụta ndị mmadụ na Naịjirịa. Ngwa nri Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa Nri bụ ihe dị oke mkpa na ndụ onye ọbụla, ọ bụ ihe a na-etinye n'ọnụ maọbụ n'ahụ iji chekwaa ndụ, nwete ikike, kwalite otuto dgz, Ọnụego ọtụtụ ngwa nri dịka osikapa, agwa, garị,yabasị na ndị ọzọ rịrị elu site n'ihe ọnụ ego ọ nọ bu na mbido afọ 2020. Akpa osikapa nọ bu n'ọnụego puku naịra 18 ruo puku naịra 25 mana ugbua ọ nọ zi na puku naịra 30 ruo puku naịra 40. Otu akpa garị nọ bụ na puku naịra asatọ mana ugbua ọ nọ zi na puku naịra 17. Mba ji iri nọ bụ n'ọnụego puku naịra atọ na ụma, ugbua mba ji iri abụọ nọ na puku naịra ise. Na mbido afọ a, a na-ere mkpụrụ yabasị anọ n'ọnụego otu nari naịra mana ugbua yabasị anọ bụ zi narị naịra ise. Mmanụ ugbọala Igwe e ji ere mmanụ Na mbido afọ 2020, ọnu ego otu lita mmanụ ụgbọala bụ N145 mana ọ gbaturu ala bụrụ N125 n'ọnwa Maachị maka ọdịda mmanụ agbịdị n'ụwa gbaa gburugburu. N'ọnwa Eprelụ, ọgbatukwuru ala ma bụrụ N123 dịka ndị na-achikwa ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Petroleum Product Pricing Regulatory Agency (PPPRA) si kwuo. E ruru n'ọnwa Julaị, afọ 2020 gọọmentị ebulie ọnụego mmadụ ụgbọala ka ọ bụrụzie N143 otu litre maka ha sị na ha chọrọ isepu aka n'ụgwọ ha na-akwụ n'isi mmanụ agbịdị. Mana e ruru n'ọnwa Sepụtemba, afọ 2020 gọọmentị bulikwara ọnụego mmanụ ụgbọala ka ọ bụrụ N151 kwa otu lita. Naanị n'ime afọ 2020, ọnụego mmanụ ụgbọala agbanweela ugboro opekatampe ugboro atọ, dịka ọ na-agbanwe ka ọ na-emetụta ndụ ndị mmadụ. Njem ụgbọala Mgbe ọbụla mmanụ ụgbọala rịrị elu, ndị na-ata ahụhụ ya karịa bụ ndị na-agba ụgbọala eme njem dị iche iche. Nke a bụ maka na ndị na-akwọ ụgbọala na-ebuli ego njem na-egbughi oge maka nke a. N'afọ a, ọ bụghị naanị maka mbuli elu ọnụego mmanụ ụgbọala mere ọnụego njem ugbọala ji rịa elu. Oge coronavirus malitere n'ụwa ma rute na Naịjirịa, gọọmentị tinyere mmachi onye apụla n'ezi maka mgbochi mfesasị ọrịa. Ngwa ngwa gọọmentị buliri mmachi a, ha nyere iwu sị ka a na-anọsa anọsa n'ụlọụka, ụgbọala, ụlọọrụ na ebe ndị ọzọ. Nke a mere ndị ọkwọ ụgbọala ji bulie ọnụego njem iji mee ka ha gbazuo ego ha maka na ụgbọala na-ebu mmadụ iri na asatọ malitere buwezie mmadụ itoolu. Christmas Travel: Ihe mere anyị ji etinye ego n'oge Ekeresimesi -Ekeson Ego ole a na-agba i si Legọs a ga Ọwụwanyanwụ nọ bụ n'ihe dịka puku naịra ise ruo puku naịra asaa n'ọnwa Febụwarị na Maachị. Mana dịka coronavirus bịachara n'ihe dịka n'ọnwa Ọgọstụ mgbe e buliri mmachi njem, i si Legọs gaa Ọwụwanyanwụ rịrị elu ọrji dawazie puku naịra iri ruo puku naịra iri na otu. N'otu aka ahụ, ime njem n'ime steetị, ebe a na-agbabu otu narị naịra aga gbanwere bụrụzie narị naịra abụọ. Etu a ka ọnụego njem ụgbọala na-ada ugbua nke nwereike itinyekwu ego n'ihi ka na-abịa abịa. Ọkụ Latrik Ọkụ latrik bụ otu ihe ọzọ dị mkpa na ndụ ndị mmadụ mana o tinyekwuru ego na Naịjirịa n'afọ 2020 dịka ibe ya. Na mbido afọ 2020 ruo ihe dịka n'ọnwa Maachị, ọnụegọ otu kilowat ọku latrik bụ N25.731 maka ịmụ ọkụ n'ụlọ, ebe ọ bụ N41.661 maka ndị ji ya na-eme azụmaahịa dịka ụlọọrụ 'GlobalPetroPrice.com' si deputa ya. Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa Mana n'ọnwa Sepụtemba, ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ Latrik bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) buliri ọnụego ọkụ latrik. Ugbua ọnụego ọkụ latrik per kilowat nọ zi na N34.28 ruo N58.22 na mpaghara Ọwụwanyanwụ nke Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) na-ahụ maka ya. Etu a ka atụmatụ ọhụrụ a malitere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 dịkwa na mpaghara Ugwu, Ndịda nakwa Ọdịdanyanwụ nke Naịjirịa. Kedụ etu o si metụta ndị Naịjirịa? Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa etiela ebewu etu mgbanwe n'ọnụego ihe ndị si metụta ha nakwa ezinaụlọ. Otu nwaanyị na-ere ahịa nri na-achọghị ka a kpọọ aha ha sị na ọ na-arazi ahụ ịzụta ngwa nri ka ọ fọdụzie irizu isi ego. Otu nwoke sị na ọ na-ama ụzọ aga ọrụ maka ego e tinyere n'ọnụego ime njem. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47649991,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47649991,Market Match: Ụmụ nwoke unu adọzịna anyị aka n'ahịa - Ụmụnwaanyị,Ụmụ nwaanyị karịrị otu nari eguzobela ngagharị iwe n'Ogbete main market Enugwu iji megide ịkwa emu na ịdọ aka nke ụmụ nwoke na-eme ha ma ha bata n'ahịa.,"Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe Onye chikọbara ya bụ ngagharị iwe bụ nwaada Juliet Keego kwuru na ihe ha jiri chikọba ya bụ ngagharị na gburu gburu Enugwu bụ ka odo ụmụ nwoke anya na nwaanyị nwe onwe ya, nke mere na Onye ọbụla enweghị ikike ịdọ ya n'aka. Keego kwuru na ọ bụ n'Ogbete main market nakwa Holyghost park ka ya bụ akparamagwa na-apụ anwụrụ nke na ndị na azụ ahịa ma ọ bụ ndị Kọndọktọ na adọkpụ ụmụ nwaanyị n'aka kwa mgbe kwa mgbe.Nwada Chinaza Anyalebechi Kwuru na ọ na abụ nwaanyị bata ahịa, ụmụ nwoke a na adọ ya n'aka na-akpọ ya ""oyiri m"" ""my size"" ""my colour ""nke nwaanyị"" "" Chichi"" ma jikwara ịkpụ mkpụrụ ọhịa akpọ nwaanyị. Juliet Kaego onye nchịnkọta ngagharị iwe a Iji gosi ka ya bụ mmiri siri baa n'opi ụgbọgịrị, ụmụ nwoke na-azụ ahịa n'Ogbete Main market gwara ndị na eme ngagharị ahụ na ha ga-akachirịrị ntị na adọkpụ ụmụ nwaanyị ka ha bịa gota ha ihe ha na ere.Ndị nchịkọta ahịa Ogbete bụ OMTA kwere nkwa ịdọ ndị otu ha aka n'ntị ka ya bụ agwa ọjọọ kwusi. Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe Akụkọ ga-amasị gi Christchurch: Buo agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa niile- Jacinda Arden" afirika-44172183,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44172183,Onye uweojii egbuola onye agha na Port Harcourt,"Ndị mmadụ chere aka ịghọrọ ihe nwere ike ịdapụta n'etiti ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa ka otu onye uweojii gbagburu onye agha n'ihi na o chere na ""ọ bụ onye ohi.""","Akụkọ kwuru na ihe a mere n'akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii dị na Rumukpakani n'ụbọchị 17 Mee, 2018. Otu onye bi ebe ahụ gwara ndị ntaakụkọ TheCable na ""ụfọdụ ndị agha nọrọ n'ụlọ nkwari akụ dị nso ụzọ Ada George. Mmadụ abụọ n'ime ha pụtara ka ha zụta nri, mana otu bu egbe n'agbanyeghị na ha eyighi uwe ọrụ ha. Oge ndị uweojii bịara, ha gwara ndị agha ahụ soro ha gaa n'ụlọọrụ ha mana ha jụrụ, nke butere nrụrịtaụka n'etiti ha. Otu n'ime ndị uweojii gbara onye agha egbe ma gbagbuo ya, ebe onye nke ọzọ ghaghachiri azụ ịgwa ndị otu ha."" Ndị ntaakụkọ Vanguard kwuru na Zaki Ahmed bụ kọmishọna ndị uweojii na Rivas steeti kwenyere na ihe a mere. O kwuru ""Ọ bụ ihe ọjọọ, mana ọ bụghị eziokwu na ndị agha na-achụ ndị uweojii."" Akụkọ kwuru na ndị uweojii na-arụ na Rumukpakani agbafuola maka ụjọ na-atụ ha na ndị agha nwere ike ịbịaghachị luso ha agụ. Ọtụtụ mgbe ndị agha na ndị uweojii na-enwe ezigbote nsogbu na Naịjirịa, ụfọdụ nke butere ogbugbu mmadu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44946982,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44946982,APC na-akwụ ụgwọ ọchịchị nchịgbu ha na-achị - Ọkachamara,Ihe mere n'afọ 2014 na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa emegharịala ọzọ.,"N'afọ 2014, ụfọdụ ndị otu pati PDP tiri mkpu na PDP anaghị achị ha nke ọma nakwa na a na-akpapụ ha akpapụ mana ọ dịka PDP egeghị ntị. Nke mere ha ji nukoro baa pati ọhụrụ bidoro oge ahụ bụ APC, nke kpokobara iji chutuo onyeisiala oge ahụ bụ Goodluck Jonathan. Otu ihe ahụ mere mbụ emeela ọzọ maka na ụfọdụ ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ụlọmeiwu nọ na pati APC etiela mkpu na a na-akpapụ ha akpapụ nakwa na pati ahụ anaghị achị ha nke ọma; ha anaghịkwa emezu nkwa ha kwere ụmụ Naịjirịa. Mana ọ dịkwa ka ndị APC egeghị ntị, otu ihe ahụ PDP mere, nke kpatara mmadụ 15 n'ụlọ omeiwu sineti na mmadụ 36 si n'ụlọ omeiwu nta nọ APC jiri wụọ ọsọ 'Ben Johnson' gbaba na PDP nakwa pati ndị ọzọ. Otu onye bụ ọkachamara na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Fidelis Edeh, gwara BBC Igbo na APC kpatara nkụ arụrụ mere ngwere ji pụtara ha ọrịrị. O kwuru na ihe kacha ewute ya bụ na ndị ọchịchị anaghị achịta nke ọma. O kwuru na ndị ọchịchị anaghị eleba anya n'ebe ndị ha na-achị nọ. N'okwu ya; ""Ihe mere taa gosiri na ọchịchị anyị ugbua, onye ọbụla ka na-azọ isi onwe ya. ""Kamgbe ọchịchị laghachitere n'aka ndị nkịtị, ọ dị ka ebe anyị nọbu ọ ka mma."" Fidelis Edeh N'akụkụ nke ya, onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọrọ bụ Sam Olisa, kwuru na ihe mere gosiri na otu pati APC amụtaghị ihe ọbụla n'ihe mere otu pati PDP n'afọ 2014. N'okwu ya; ""Ọtụtụ ndị mmadụ ga na-eche na ọ bụ maka onwe ha mana echeghị m na ọ bụ maka onwe ha maka na onye ọbụla ruru ọkwa omeiwu na Naịjirịa abụghị obere mmadụ ga na-eme ihe maka ihe ndị chere. ""Eche m na ọ bụ maka na ndị ndu pati ha egeghị ha ntị mana si akpafu n'ụzọ ha kwesiri ịnọ, ala anyị na onwe ya na-apụkwa n'ụzọ, ọkachasị ihe gbasara nchekwa. ""Ọ bụ ọrụ gọọmentị na mba niile ichekwa ndị ha na-achị mana oge gọọmentị otu pati na-agwa ndị ha na-achị otu ihe maọbụ ihe ọzọ na ha echekwanwughi ndụ ndị mmadụ, ị mara na ihe mere taa bụ maka na ndị nọ pati ahụ anọkwataghịzi. ""Eche m na ihe mere taa dị mma maka ọchịchị onye kwuo uche ya."" O kwukwara na agaghị ahụkwa mgbanwe ọbụla n'aka ndị pụrụ maọbụ ndị nọ maka na pati niile nọ Naịjirịa bụ otu, ""ha niile enweghi nke nwere ezi atụmatụ na-achị ha."" Otu ihe dị mkpa ịmata bụ na 2019 na-abịa ma pati niile na-achọ ịbụ ndị ga-enwe mmeri. Ndị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu Anyị niile nọ n'ebe APC nọ ugbua na-ajụ ma ihe mere PDP na ntuliaka 2015 ọ ga-emekwa ha? Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52326019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52326019,Infectious Disease: Etu ndị Igbo si eme ndị bu ọrịa na-efe efe n'oge gboo,"Dịka ọrịa coronavirus na-anyụ mba ụwa niile ịkpakwụ ugbua, ndị ọkachamara n'okwu ahụike enyela iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ.","N'ihi etu ya bụ ọrịa si efe, onye ọbụla butere ya, ihe mbụ a na-eme bụ iwepụ onye ahụ n'akụkụ ebe mmadụ agaghị na-eru ya nso. N'akụkụ ụwa niile, ndị mmadụ akọola akụkọ obi mgbawa etu ndị nke ha nwere ọrịa coronavirus si nwụọ na-enweghi onye ọbụla bịara ha nso. N'ala Igbo n'oge ochie, ihe mere oge ahụ adịchakwaghị iche n'ihe na-eme ugbua. Ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Tobe Nnamanị, onye mere nnyocha miri emi n'omenala ndị Igbo, gwara BBC na ndị Igbo na-elegara ọrịa na-efe efe anya n'ụzọ abụọ: Nke mbụ bụ etu o si metụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Nke abụọ bụ etu o si metụta mmadụ na ndị mmụọ. Ọrịa na-efe efe n'ala Igbo 'Chicken pox' so n'ọrịa na-efe efe nke ndị Igbo na-atụ egwu n'oge gboo Fada Nnamani kwuru na ọrịa na-efe efe ndị Igbo ma gụnyere: Ahụ ntukasị (Chicken pox, small pox) Ekpenta Ito afọ Otoro Akpata maọbụ Ịkpata (Measles) Ihe nwere ike ịkpata ọrịa na-efe efe N'oge gboo, ịṅụ iyi asị bụ otu ụzọ e kwenyere na mmadụ nwere ike isi bute ọrịa ọjọọ N'ihi na ọrịa ndị a abụghị ihe a na-ahụ kwadaa, a na-ewekarị na onye bu ya bụ ọrịa mere arụ nke mere ala ji ata ya ahụhụ. Oge ụfọdụ o nwere ike ọbụghị onye ahụ n'onwe ya, kama nnanna ya maọbụ onye lọrọ ya ụwa metere ihe ndị mmụọ ji ata ya ahụhụ. Mana oge ụfọdụkwa ọ bụrụ ihe mmadụ mere mmadụ ibe ya, maọbụkwanụ ihe ọdachi dakwasara mmadụ. Etu e si eme onye nwere ọrịa na-efe efe N'oge ugbua, ndịọrụ ahụike na-eyichi ahụ ha niile tupu ha emetụ onye nwere ọrịa na-efe efe aka Dịka Fada Nnamanị si kwuo, ọ bụrụ na a chọpụta na mmadụ nwere ọrịa nwere ike ikpochapụ obodo, a ga-eme ngwa ngwa wezụga onye ahụ iche ebe mmadụ na-agaghị na-eru ya nso. Nke a ka bekee na-akpọ 'quarantine' n'oge ugbua. Fada Nnamanị kwuru sị: ""Ọ bụrụ onye kpara arụ, maọbụ onye ṅụrụ iyi asị, a ga-edopu ya n'ajọ ọhịa."" ""Mana ọ bụrụ na ọbụ ihe mmadụ mere ibe ya, maọbụ ọdachi dakwasara mmadụ, a ga-edopu onye ahụ n'ime ụlọ ya."" ""E bute nri, a dọwa ya n'ezi ma kụọ ogene maọbụ ekwe iji gwa onye ahụ na a dọwala nri ya."" ""Onweghi onye na-eru ya nso. Nke a yitere 'social distancing' anyị na-eme taa."" Etu e si agwọ ọrịa na-efe Onye rịara ọrịa ọjọọ na-efe efe mechaa gbakee, a na-emekwa omenala iji sachaa ala ma sachaa obodo tupu onye ahụ na ndị ọzọ ebido mmekọrịta Fada Nnamani gara n'ihu kọwaa na e nwere ndị dibịa mgbọrọgwụ na-agwọ ọrịa ndị a n'oge ahụ. ""Ọ bụrụ onye toro afọ, dibia gwọkọchaa mgbọrọgwụ nye ya, ọ nyụsịa ihe ndị dị ya n'afọ, afọ ya adakwaa ọzọ."" ""Ọ bụrụkwanụ onye ihe turu n'ahụ, a ga-eji mgbọrọgwụ na ahịhịa dị icheiche gwọkọọ n'ime ude ma nye ya ka ọ na-ete n'ahụ."" E nwere ndị dibịa n'oge gboo ndị ma anya mgbọrọgwụ na ahịhịa e ji agwọ ọrịa dị icheiche Mana, Fada Nnamani kwukwara na onye rịara ụdị ọrịa gbakechaa, a ga-achụkwa aja iji sachaa ala, sachaa obodo tupu ya na ndị mmadụ ebido mekọrịtawa ọzọ. Ugbua, sayensi emeela ka anyị mata na ụfọdụ ọrịa ndị a abụghị abụmọnụ ndị mmụọ na-akpata ha. Mana etu e si eme ndị bu ọrịa ndị a n'oge ugbua ka yikwara etu e si eme ha n'oge gboo, nke bụ iwepu ha iche ka ya bụ ọrịa ghara ịgbasa." afirika-51053613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51053613,Ego ole ka Harry na Megan na-agbakụta azụ ugbua ha chọrọ ịchọwa akara aka ha?,"Obi adịghị ezinaụlọ Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth mma na nwanwa ya bụ Harry na nwunye ya bụ Meghan kwupụtara na ha ga anọrọ onwe ha, chụwa ego nke ha.","Harry na Meghan lụrụ onwe ha n'afọ 2018 Ụbọchị Wenezde, Harry na Meghan kwuru na ha achọghịzịkwa ịbụ ndị welitere isi n'ezinaụlọ eze, na ha chọrọ ịgawa Kanada nakwa Amerịka ịchụ akara aka ha. Nke a na-abịa ọnwa ole na ole ha tụchara arịrị maka agwa ọjọọ ndị ụlọọrụ akụkọ na-akpaso nwunye bụ Megan. Okwa ha mara maka ịchụwa ego nke ha butere okwu ebe ka ego ha na-eribu si? Ego ole ka ha na-enwetabu? Di na nwunye a gbara ama na pasent 95 ego nnweta ha si n'aka Ọkparaeze Charles, nna Harry. Meghan na Harry bụ nnu na mmanụ Ọ na-akwụ ha ụgwọ ọrụ ọha ha na-arụ dịka 'Duke' na 'Duchess' nke Sussex nakwa ego igbo mkpa ezinaụlọ ha. Harry na Meghan eritela ike karịrị nde paụnds ise(#5m) nke pụtara ijeri naira abụọ na ụma(N2,355,000,000) bido n'afọ 2018 a lụtara Meghan were rue 2019. Ego bụ ego si n'ụlọ na ihe na-amịta ego nke Charles si na ya nweta ihe ruru £21.6m. Ha na-enwetakwa pasent ise ego site na 'Sovereign Grant' bụ ego obi eze na-eketa. Harry na Meghan eketakwara ego ruru £13m bụ ego nne Harry bụ Diana hapụrụ. Diana dịka ya na ụmụ ya Harry na William zụkọtara o ge ha gara Toronto n'afọ 1991 Harry ketakwara ego na ekpe nnenne bụ nne mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth hapụrụ. N'onwe ya, Meghan na-erite ego ruru £38,300 site n'ihe nkiri o sonyere na ya, ejiji nakwa ide ihe na intanet. Iwu ji ezinaụlọ Ezenwaanyị Briten enyeghị onye ọbụla bụ onye ezinaụlọ ahụ ohere ịrụ ọrụ ọzọ iji kpata ego. Ọkwa ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị Elizabeth na etu ha si nọrọ nso n'oche Eze Briten Ugbua ha chọrọ ịchụwa nke ha, a na-eche na ha ga-ebido nwetawa ego site na ide akwụkwọ. Ha gbaburu ama na ha chọrọ ibido ụlọrụ na-enyere ndị mmadụ aka. Ha nwekwara ihe ndị ha tinyere aha 'Royal Sussex' ha na-ere dịka mkpọ eji etinye mkpịsị odee, ihe egwuregwu nakwa ọzụzụ banyere agụmakwụkwọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49950411,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950411,2020 Bugdet: Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ,Onyeisiala Buhari ga-ebugara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ gọọmenti ga-eji mefu akụ na ụba n'afọ 2020 taa.,"Buhari ga-ebupute ya bụ akwụkwọ n'ụlọomeiwu nta. Ya bụ mmemme ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihie taa. N'ụbọchị monde bụkwa ụbọchị asaa nke ọnwa Oktoba ka ndị otu 'Federal Executive Council' nwere ọgbakọ iji hazicha ọfụma ihe gbasara ya bụ akwụkwọ mmefu ego. N'izu ụka gara aga ka Buhari nwere akwụkwọ nke bekee kpọrọ ""2020 Medium Term plan document, Medium Term Expenditure Framework (MTEF) and Fiscal Strategy Paper (FSP)"" buga na Sineti. Akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa agbaala ya bụ ụlọomeiwu okirikiri ma di njikere inabata ma mee ndị ga-abịa emume ahụ ezi nyocha tupu anabata ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-45180263,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45180263,Ihe ị ga-eme maọbụrụ n'ịhụ nwata etufuru etufu n'ọhịa,"Obi ka na-agbawa ọtụtụ mmadụ hụrụ nwata ọhụrụ etụfuru ụnyaahụ n'ọwa mmiri n'Ọgbọ-Efere nke dị nso na Head-Bridge, Ọnịcha.","Nwa ọhụrụ atụnyere n'ọwa mmiri Mana o nwree ihe i nwere ike ime maọbụrụ na ị hụ ụdị ihe a n'ihu? Gịnị ka i ga-eme maọbụrụ na nwata ahụ ka dị ndụ? Otu nwaanyị aha ya bụ Maryanne Mapenzi na-arụ na Christianah Fate Foundation gwara BBC Igbo na ọdịzị n'aka ndị obi ebere ịgba mbọ hụ na nwata ahụ anwụghị. Mapenzi kwuru na ọtụtụ oge ụmụ ọhụrụ ka dị ndụ oge ndị mmadụ hụrụ ha mana onweghi ihe ha na-eme maka ịzọ ndụ nwata a. Ọtụtụ oge, ihe a na-eme makana ha amaghị ihe ha kwesiri ime ịzọ ndụ nwata ndị a. Ihe ị kwesiri i me maọbụrụ na ihu nwata ọhụrụ atufuru Ọtụtụ ndị ụmụaka na Naijirịa na-ata ahụhụ Gịnị mere ọtụtụ mmadị anaghị azọ ụmụata ndị a? Mapenzi kọwara na ndị mmadụ na-esepu aka n'ịzọ nwata ndị a etufuru etufu maka nsogbu ndị uweojii. O kwuru na ""Ihe a bụ ihe na-ebute nnukwu egwu, makana ọ bụrụ nwa ahụ nwụrụ n'aka onye chọrọ ị zọ ndụ ya, onye ahụ ga-aza ajujụ n'aka ndị uweojii. Mana ọkaiwu Ebuka Iwuezi kọwara na iwu ala Naịjirịa ekpebịghị na onye zọrọ mmadụ nọ na nsogbu. O kwuru na: ""Ọ bụrụ na ịgbara mbọ nịịle ịlekọta nwata ahụ anya mana nwata ahụ mecha nwụọ, onweghị onye ga-awụchị onye ahụ makana nwata ahụ esighị n'aka ya nwụọ."" Mana Iwuezi kwusiri ike na ndị omeiwu kwesiri ihiwe iwu ga-echekwa ndị na-azọpụta ụmụaka. Ihe ndị uwe ojii na-ekwu Ọnụ na-ekwuchiri ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed gwara onye ntaakụkọ anyị n'elu ekwentị na ya hụrụ foto nwata ahụ etufuru n'Ọnịcha n'elu social media mana onweghị onye zitere ozi ọbụla maka mpu a n'ụlọọrụ ya. Mana ọ gọsịrịke na onweghị ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla ga-anwụchị onye zọpụtara nwata ọhụrụ etufuru efuru. Mohammed sị: ""Udi omeme a pụtara na onye ahụ bụ ezigbo ala Naịjirịa."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45967484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967484,Ifeanyi Ubah: SEC amachịbeghị Capital Oil,Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara azụmahịa nakwa akụnaụba obodo bụ Ugochukwu Obi-Chukwu agwaala BBC Igbo na SEC amachibeghi Capital Oil.,"Ụlọntaakụkọ dị icheiche na-ebu akụkọ na SEC bụ ngalaba na-ahụ maka ego ahịa na Naịjirịa amachiela Capital Oil nke Ifeanyi Ubah nwe maka mpụ ego ruru ijeri naira ise. Mana Obi-Chukwu kwuru na ọ bụ ndọmọdụ ka ụlọomeiwu nyere SEC, gwa ha machie ya bụ ụlọọrụ ahụ n'abụghị na-amachiela ya. O kwukwara na SEC ga-amalite ịme nyocha nke ha maka ebubo a eboro Capital Oil tupu ha amara ihe ha ga-eme maka ya. ""SEC nwere ikike ị chụsasị ndị isioche Capital Oil maọbụrụ na ebubo ahụ bụ eziokwu mana ha ga-eburu ụzọ mee nyocha"" ka Obi-Chukwu kwuru. Cheta na n'ime akwụkwọ ozi AMCON bụ ngalaba na-elekọta akụnaụba ndị na-azụ ahịa wepụtara n'abali abụọ gara aga, aha Ifeanyi Ubah bụ nke mbụ na ndị kachasị ji ụgwọ na Naịjirịa. Ya mere ndị mmadụ ji eti mkpu n'elu soshal midia. Akukọ ndị ga-amasị gị:" 42886634,https://www.bbc.com/igbo/42886634,Gịnị mere ndị ụlọakụ ji amịpụ ego ndị mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi?,Ọtutụ ụmụ Naịjirịa ajụọla ajụjụ a dịka ha na-ekwuputa mwute ha gbasara ego ndị ụlọakụ ha na-ewepu n'ego ha n'ụzọ na-ezighi ezi.,"Etu ndị ụlọ sineti ga-esi mezie ego ndị ụlọakụ na-ewepụ N'ọnwa Jenụwarị 2018, ndị ụlọomeiwu sineti kpọrọ onyeisi ụlọakụ ukwu (CBN) bụ Godwin Emefiele, ka ọ bịa zara ọnụ ya ma kọwaara ụmụ Naịjirịa ihe kpatara o ji dị ka ego ha enweghizị ezigbo nchekwa n'ụlọakụ ebe ha debere ya. Nke a bụ maka na ọbụrụ na ndị ụlọakụ anaghị ewepu ego maka ozi ha zitere gi, ha na-ewepu ego maka kaadị eji ewere ego. Ndị a abụghị nsogbu mana ihe na-agbagwoju ndị mmadụ anya bụ ugboro ole a na-ewepụ ego ndị a n'ime otu ọnwa. Nke a bụ maka na otu onye ihe a metụtara gwara BBC Igbo na oteela ihe a na-eme, wee zitekwara anyị foto ụfọdụ gbasara mwepụ e mere n'ego ya. Ewepụrụ ego maka otu ihe ugboro atọ n'ọnwa Foto a na-egosi ego ndị ụlọakụ a wepụrụ n'ego mmadụ maka otu ihe n'ime naanị ọnwa Jenuwarị. Ha wepụrụ naịra iri ise n'ego onye ahụ ugboro atọ maka otu ihe n'ọnwa Jenụwarị. Ọbụghị naanị ihe a ka ndị mmadụ na-ekwu maka ya, a na-ekwukwa na ebuturu ego ole a na-ewerezi n'igwe eji ewere ego bụ ATM n'aha ịchafụ. Tupu ugbua, ATM na-enye ihe ruru puku naịra iri abụọ otu oge nke bụ ị dọrọ ego rue ugboro atọ n'ụlọakụ na-abụghị ụlọakụ gị, ewepụ ego maka ya. Mana ugbua, ọtụtụ ụlọakụ na-enye naanị puku naịra ise nke pụtara na tupu ị were puku iri abụọ ahụ i nwere ike iwere na mgbe mbụ, ị ga-ewere ego ihe ruru ugboro anọ, ị chọzịa iwere ihe ruru puku otu narị naịra, a ga-ewere ego gị karịa. Ndị na-eweta ego ruru puku otu narị naịra nwere ike ịkwụ ụgwọ karịa ugboro iri Gịnị kpatara ihe dị otu a ji eme ebe ndị ụlọakụ nwere ndị ntuziaka bụ ụlọakụ ukwu CBN? Ọpụtara na CBN anaghị etinye uchu n'ihe ndị ụlọakụ a na-eme? BBC Igbo gbalịrị inweta ndị ụlọọrụ CBN mana ha azaghị oku. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43369493,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43369493,Benue: Njem Buhari a adighị ka nke Plateau,Onyeisiala Buhari mere njem na Benue steeti maka isoro ha rue ụjụ maka ndị nwụrụ n'ọgbaghara ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo.,"Ndị Benue nwereike ị na-ewe iwe maka oge onyeisiala gburu ị bịa leta ha Mana nnabata ya adịghị ka mgbe ọ gara Plateau steeti dịka okporoụzọ niile tọgbọ chakoo ka onyeisiala bịara n'obodo ahụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ a pụtaghị bia zute ya. N'okwu ya o kwuru na mwakpo na-emekarị na Benue bụ ihe na-eme gọọment obi ọjọọ, ma kwe nkwa na gọọment ga akwụsi ya. ""Agaghị m eleghara gbuogbuogbuo na-eme na Benue n'akụkụ Naijria ndị ọzọ.mwakpo na-emekarị na Benue na eme m obi ọjọọ. Anyị na-agba mbọ ime ihe niile iji kwụsị ya."" Ka akụkọ a na-apụta, ndị Miyetti Allah ji ohere ahụ na-arịọ mgbaghara maka ihe mere n'etiti ha na ndị ọrụụgbo n'obodo dị iche iche na Benue steeti. Ọtụtụ mmadụ kwuru na njem Buharị na Benue abiaghi no oge Cheta n'ịzụka iri garaga n'ime obodo Logo na Guma ndị ji egbe ha ana-ebo na ha bụ ndị ọchịehi gburu ọtụtụ ndị ọrụụgbo n'ime obodo di iche iche na Benue steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51580085,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51580085,Tony Ubesie: Akatamkpo nwoke gbara mbọ maka nkwalite asụsụ Igbo,"Ọ bụrụ na Tony Uchenna Ubesie ka nọ ndụ, taa ka ọ gaara agba afọ iri asaa na otu.","Isi akwụ dara n'ala so n'akwụkwọ mbụ Tony Ubesie dere Ma na-agbanyeghị na ya bụ nwa amadị e ji eje mba alaala mmụọ, ama ka na-agbakwa maka ike ọ kpara iji wulite asụsụ Igbo . Onweghị nwa afọ Igbo ọbụla mụrụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na-agụghị ọbụladị otu n'ime akwụkwọ Ubesie dere. Ubesie abụghị onye mbụ ji Igbo dee akwụkwọ akụkọ, mana aha ya kacha ada ụda ma a gụwa ndị odeakwụkwọ Igbo. Onye bụ Tony Ubesie? Tony Ubesie gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka Ubesie bụ onye obodo Achị nke dị n'okpuru ọchịchị Oji Riva nke Enugwu steeti. A mụrụ Ubesie n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1950 n'Enugwu. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka ebe ọ mụrụ maka asụsụ bụ nke Bekee kpọrọ 'Linguistics'. Akụkọ kwuru na Ubesie so na ndị agha Biafra oge a lụrụ agha. Ka agha Bịafra bichara n'afọ 1970, Ubesie malitere ide akwụkwọ akụkọ iji kọwaa ihe dị icheiche ndị mmadụ gabigara n'oge agha. Akwụkwọ Ụkwa ruo oge ya kọrọ akụkọ maka Chude na Ngọzị Ọtụtụ akwụkwọ o dere gbadoro ụkwụ n'agha Biafra. Ubesie so na-agbụrụ nke abụọ ndị ji asụsụ Igbo dee akwụkwọ. Agbụrụ nke mbụ bụ ndị dere akwụkwọ nke ha tupu alụọ agha. Ha gụnyere Pita Nwanna (onye dere Omenụkọ), D.N Achara (onye dere Ala Bingo), Leopold Bell-Gam (dere Ije Ikpo Jere), na ndị ọzọ Akwụkwọ Ụbesie dere Jụọ Obinna bụ maka nwoke na-ezogharị oge agha Bịafra Ọ bụ eziokwu na ihe e ji mara Ubesie bụ akwụkwọ akụkọ isii o dere, mana ọ bụghị naanị ha bụ akwụkwọ o dere. Ubesie dere abụ itoolu n'ime akwụkwọ abụ a kpọrọ 'Akpa Uche'. O nwekwara otu akwụkwọ ejije. Akwụkwọ akụkọ ya gụnyere: Ubesie bụkwa onye ntaakụkọ, onye nhazi ejije nke Bekee kpọrọ ""theatre director"" nakwa onye nkwalite ọdịnala. Ọnwụ Ubesie Nke a bụ akụkọ nwata Enyi na ndị otu ya mechara bụrụ ndị ekperima Dịka e si depụta n'ọba ozi wikidata.org, Tony Ubesie nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Mmakụ dị n'Enugwu. Ihe mberede a mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1994. Mana ndị Igbo na-atụ ilu sị, ""Dimkpa taa akụ, a hụ ichere ya"". Ubesie gbalịrị ike ya ịkwalite asụsụ Igbo oge ọ dị ndụ, ye mere ude ya ka ji ede na-agbanyeghi na o meela afọ 26 ọ larala mmụọ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ubesie Ogbonnaya Mark bụ nwaokorobịa na-ede akwụkwọ Igbo kwuru na ọ bụ Ubesie kpalitere ya o ji malite inwe mmasị ịkwalite asụsụ Igbo. Prince Ik Okolo gbakwara ama na Ubesie bụ dike e ji aga mba n'ịkwalite asụsụ Igbo. @OnyeAjụjụ na @ikifediata kwuru na onye chọrọ ịmụta asụsụ Igbo, ya gụọ akwụkwọ Ubesie." 45749834,https://www.bbc.com/igbo/45749834,Otele ukwu egbuola nwaanyị ọzọ,Nwanyị ọzọ sị mba Britain anwụọla ebe ọ gara ụlọọgwụ makana ọ chọrọ ukwu sara mbara.,"Ọtụtụ ụmụnwanyị chorọ otele dịka Kim Akụkọ kọwara na nwaanyị a nwụrụ oge ọ gara ịnata atụmatụ ahụike nke akpọrọ ""Brazilian butt lift"" na Bekee. Ara m bụ oke ibu arụ nye m Cheta n'ime ọnwa Ọgọst nke afọ a, otu nwanyị aha ya bụ Leah Cambridge nwụrụ na mba Tọkị ebe ọ gara ịnata asambala ukwu. Ike m bidoro ihi ehi Otu nwanyi ọzọ dị afọ 23 gwara onye ntaakụkọ BBC na ike ya bidoro ihi ehi mgbe ọnwa atọ gachara ka mgbe ọ gara ịnata otele ukwu a. Ọtụtụ ụmụnwanyị chorọ otele dịka Kim 'Ike m tupuru atupu nke mere na iga ije na-ahịa ahụ, ahụ m niile bidoro ishi nnukwu ishi"" Onye ọzọ gwara BBC na iba banyere ya n'ahụ oge ọ lata ukwu a, nakwa na mgbe niile ya kpọrọ ụlọọgwụ a maka nyemaka, onweghi onye buru ekwenti ya ọzọ. ""Kwụsị nụ emume a"" Ndị dibia Bekee ji ohere a eti mkpu ka ụmụnwanyị kwụsị ịnata atụmatụ ahuike a. Ngalaba kpọrọ onweha""British Association of Aesthetic Plastic Surgeons"" kwuru na ọ bụ ya bụ usoro kachasị eri ndụ mmadụ. Ndị dọkịnta kọwara na ha na-agbanya abụba n'ime ike onye ahụ chọrọ ukwu sara mbara. Mana ụfọdụ oge ha ga-agbanye abụba n'ime akwara na-ebu ọbara gawa ụbụrụ maọbụ mkpuruobi na amaghị ama. Nke a na-ebute ọnwu. Akụkọ ga-amasị gị" 45443968,https://www.bbc.com/igbo/45443968,Falana: #FSARS egboghị nsogbu ihazigharị ọrụ nchekwa ndị uweojii,"Falana bụ onye ọkaiwu ama ama kpọrọ oku ka e nwee ndị uweojii nke steeti, sị na o nweghị mba a na-enwe naanị ndị uweojii etiti.","Femi Falana kwuru na uweojii steeti ga-egbo nsogbu nchekwa na Naijiria O kwuru na ọ bụ ndị uweojii steeti ga-egbo nsogbu nchekwa a na-enwe ugbua n'ala Naijiria ma gwa ndị gọvanọ ka ha kwado ndị uweojii steeti. Ọ tụrụ arịrị na ndị gọvanọ anaghị eji ohere e nyere n'iwu ala Naijiria tinye anya n'etu ọrụ ndị uweojii si aga. ""Iwu Naijiria nyere ohere ka e nwee ngalaba na-ahụ maka ndị uweojii a kpọrọ 'Nigerian Police Council' na Bekee"". ""Ngalaba onyeisiala nọ dịka onyeisioche, ebe onyeisi ndị uweojii, onyeisioche kọmịshọn na-ahụ maka ndị uweojii nakwa ndị gọvanọ steeti 36 sonyekwara. ""Mana ọ dị mwute na ndị gọvanọ anaghị etinye aka ka ọrụ ndị uweojii si aga dịka iwu Naijiria siri kwado."" Onye kọmishọna uweojii nọ ezumike nka kọwapụtara uche ya gbasara uweojii steeti Na nke yiri ibe ya, Falana nọ ebe ọzọ katọo okwu Onyeisiala Muhammadu Buhari, ebe o kwuru na ichekwa ala Naijiria ka mkpa karịa ikike dịrị onye, sị ' Mbọ izu na azụ mbọ maka ichekwa Naijiria na-enupụ isi n'ihe ụlọikpe kpebiri bụ ""iji aka akpọ nsogbu oku."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44384131,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44384131,Ụmụnwaanyị na-egoli maka mbugo ọnwa ọmụgwọ,Ụmụnwaanyị etoola gọọmentị etiti maka iweli ọnwa ole nwaanyị mụrụ nwa na-anọ ezumike ọmụgwọ tupu o bidokwa ọrụ.,"Ụmụnwaanyị na-anọbu ezumike ọmụgwọ ọnwa atọ Na mkparịtaụka ha na onye ntakụkọ BBC nwere, ha kwuru na ọ ga-enyere ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ohere ileta nwa ha ma letakwa onwe ha. Nkiru Santos kwuru: ""Ọ dị mma, ọ ga-enye nne ohere iji leta nwa ya ma zukwa ike ọfụma."" Santos onye bụ onyenkuzi gara n'ihu kwuo na ""ugbua ọ ga-adịzị mma ka mmadụ turu ime"" N'okwu ya, Chika Obika kwuru na o ga-ebelata oke ọnwụ ụmụaka ọhụrụ na-anwụ n'ihi enweghị ezi nleta. ""O nwere ọtụtụ ụmụaka na-anwụ n'ihi na ha butere ọrịa maka na ha na nne ha anọkọghị ọfụma. Ọ ga-enyekwa ohere ka nwaanyị doo ahụ."" Mịnịsta na-ahụ maka okwu gbasara ọrụ bụ Chris Ngige kwupụtara n'ụbọchị Tuusde n' ọgbakọ ọrụ mba ụwa na-aga n'ihu ugbua na Geneva dị na Swizaland na Gọọmenti etiti ebulitela ọnwa ole nwaanyị na-anọ ọmụgwọ site na ọnwa atọ rue ọnwa anọ. Ngige gwara ndị bịara nzukọ ahụ na a machiela nb ndị na-ewe ndị mmadụ n'ọrụ gọọmentị nakwa nke ụlọọrụ kwụrụ onwe ha n'ala anyị ịchụ nwaanyị ọbụla n'ọrụ maka ọnọdụ alụmdị maọbụ ịmụ nwa. Ọ gara n'ihu kwu sị,"" Iwu ji ndị nwe ụlọọrụ n'ala Naijiria iwepụtara ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ebe nlekọta nwa n'ụlọọrụ ha. ""N'ọrụ gọọmentị,, e mere ka ọnwa ọmụgwọ site na izuụka iri na abụọ gbalite rue izuụka iri na isii; iji nye ohere ka nwa na nne nweta onwe ha ọfụma, ọkachasị ka ọsi gbasa inye nwa ara."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: ""Naa mgbakwụịnye, ntarahaụhụ ọbụla a chọrọ nye nwaanyị nọ n'ọmụgwọ ga-echere ganye na ohere ezumike ọmụgwọ akwụsị."" Ngige kwukwara na mmabido ọhụrụ a bụ iji chekwa ụmụnwaanyị nọ n'ọmụgwọ n'ala Naijiria." afirika-44090257,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44090257,Onyeisiala Buhari kwuru na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara,"Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari kwuru na ahụ siri ya ike, na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara ime na UK.","Buhari kwuru na ọ ga-eso n'ọsọ ntuliaka 2019 Ka ụgbọelu bu ya fedatara n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikwe n'Abụja n'elekere asaa nke abalị, ndị ọrụ ya na ụfọdụ ndị ntaakụkọ zutere ya. Otu onye ntaakụkọ jụrụ ihe kpatara o ji bata otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta (nke bụ ụbọchị satọdee). Buhari zara ya sị ""Ọ bụghị tupu oge a tụrụ anya. Naanị nyocha ahụ ka m gara mana ahụ siri m ike, daalụ."" Buhari gara njem n'ala Briten n'ụbọchị tuusde ebe ọ gara ịza oku dọkịta ya kpọrọ ya. Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Garba Shehu bụ onye dere ya na Twitter. Cheta na Buhari nọrọ ihe ruru ọnwa anọ na Briten n'afọ 2017. Njem nke a o mere n'izu a kpalitere ajụjụ ndị mmadụ chọrọ ịmata ma ahụ o siri ya ike isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke a ga-eme n'ọnwa Febụwarị 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44234885,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44234885,Ndị Igbo na chi ha na-efe,Ala Igbo bụ ebe amaama dịka ala na-akwado mmụọ dị icheiche dịka dọkịta Chigọzie Nnabụihe sịrị kọwa.,"Dịka ala, agwọ eke bụ onyeozi ọtụtụ ofeke mmụọ Ufọdụ mmụọ a biri na mbarigwe, n'ime mmiri, n'ime ala na ebe ndị ọzọ. N'ime akụkọ nke a, anyị ga-agosiputa mmụọ dị icheiche n'ala Igbo nakwa ka e si efe ha. ALỤSỊ Alụsị bụ mmụọ di icheiche so Chi-ukwu n'usoro mkpa n'ala Igbo. (Anyị ga-akọwa maka Chi na ngwụcha akụkọ a). Alụsị n'ala Igbo dị icheiche. Ụfọdụ n'ime ha bụ: ANYANWỤ na ỌNWA Anyanwụ bụ Chi a na-efe na mba ofesi dị iche iche Anyanwụ na Ọnwa bụ mmụọ abụọ ndị Igbo nwere nkwenye na ha bụ ndị ozi Chi. Anyanwụ bụ anya Chi, ọ na-aga njem na mbara igwe. O si ọwụwa anyanwa na-aga ọdịda anyawụ ụbọchị niile. Dọkịta Chigọzie Nnabụihe kwuru na ndị Igbo kwenyere na omenala ndị Nri na-efe anyanwụ nke ukwuu nke bụ na ha na-egbu akara ya n'ihu. Igbo nwere nkwenye na Anyanwụ bụ Chi na-enye ahụmaụzọ. Dika ka ọkụ anwụ sị achụsa ọchịchịrị, Chi nke a na-ekpupụ ihe niile dị na nzuzo. Igbo nwekwa nkwenye na ọnwa bụ ndị ozi Chi-ukwu. Dịka akụkọ a sịrị ga, ụbọchị niile ka Chi-ukwu na-ezipu Anyanwụ na Ọnwa gawa ụwa. Ọnwa na Ala bụ ụmụnne Anyanwụ sị ọwụwa anyanwụ na-aga ọdịda nyanwụ nakwa ọnwa sị mpaghara ugwu na-aga ndịda. Ha abụọ bụ mmụọ kewara ụbọchị anọ dị n'ọnụ ọgụgụ ụbọchị n'ala Igbo akpọrọ Nkwọ, Eke, Orie na Afọ. Dika ndị Igbo siri nwe nkwenye, mmụọ ndị a bụ ndị na-agwa 'Chi' ihe niile na-eme n'uwa. IKENGA Ikenga bụ mmụọ ama ama n'ala Igbo. Omenala kọwara na ọ bụ ya bụ sọọsọ Chi puru mpi nakwa siri ezigbo ike. Ikenga bụ chi akachasị enwe akpụrakpụ ya n'ala Igbo N'oge gboo, ụmụnwoke niile n'ala Igbo nwekwa agba n'ime ọgbọ ha nwere Ikenga nke ha na-efe, ụfọdụ ụmụnwaanyị nwekwara Ikenga nke ha. Dika Igbo siri wee nkwenye, Ikenga bụ mmụọ na-enye akanaụba, mmerị n'oge agha na ihe ọma ndị ozọ. Ha na-eji ọbara ọkụkọ maọbụ ewu nakwa ji na ose were turu Ikenga aja. NDỊ ICHIE Ndị Ichie bụ ndị nna-nna bi buru n'oge garaaga. Ha bụ mmụọ na-eyi nnukwu egwu oge ọbula, maka Igbo were nkwenye na ha nwere ike ị nye ngọzị maọbụ bụọ onye ahụ ọnụ. Ezenaụlọ niile n'ala Igbo nwere 'Ndị Ịchie' nke ha, dịka omenaala siri kọwa ha bụ mmụọ na-erị ndụ nke ọma makana oge niile ka a na-atụrụ ha aja. Ndị Ichie bụ mmụọ na-enye amamihe, mana Igbo anaghị efe ha, sọọsọ nsọpụrụ ka ha na-enye ha. Igbo nwekwa nkwenye na Ndị Iche lọrụ ụwa. ALA Omenala kọwara na mmụọ Ala bụ nwaanyị. Ọ bụkwa mmụọ ama ama na-enye nwa. A gafesie Chi-ukwu, ala bụ mmụọ kachasị mkpa n'ala Igbo. N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ala nwere ike imesu onye ọbụla kpasuru ya iwe. Ọ bụkwa mmụọ a na-ahụ na ihe niile a kọrọ n'ugbo mịrị mkpụrụ, na-ahụ na mmiri dị n'ala oge ọbụla. Igbo nwere nkwenye n'ala bụ nne na-enye ndụ. Igbo nwere nkwenye na Chi-ukwu si ala nwe kee mmadụ. Ihe a mere ka ọ bụrụ iwu na ha ga-eli onye Igbo nwụrụ anwụ n'ime ala. Mana, onye ọbụla kpasoro ala iwe, Igbo nwekwara nkwenye n'ala ga-ajụ ahụ onye ahụ. Dịka ka omenaala sịrị kọwa, Amadịọha bụ Di Ala, nakwa na-agwọ Eke bụ onyeozi mmụọ a. Ọ bụ Ala bụ mmụọ na-elekọta iwu niile dị n'ala Igbo nakwa chekwa ụmụnwaanyị na ụmụaka. A na-efe Ala ruo ugbua na mme mme iri jii ọhụrụ. OFEKE MMỤỌ Dịka ala, agwọ eke bụ onyeozi ọtụtụ ofeke mmụọ Ofeke Mmụọ bụ mmụọ ọjọọ. Dịka ndị Igbo siri nwe nkwenye, n'Ogbanje na mmụọ mmiri bụ ndị kacahsị bụ mmụọ ofeke ama ama. Ụdịri mmụọ a na-ebuta nnukwu egwu, ha nwekwa ndị na-efe ha ruo ugbua. Dika ihe esemese anyị gosiri, ọtụtụ n'ime ndị mmụọ a na-apụta dịka ụmụnwaanyị machara mma nakwa nwere akụnaụba na ike. Igbo nwere nkwenye na mmụọ mmiri a na-ebi n'ime mmiri dị icheiche n'ala Igbo. Nnukwu mmiri dịka nke Njaba, Oshimiri nakwa Ota mmiri dị n'Imo steeti bụ ebe ha nwere nkwenye na mmụọ mmiri bi. Ọgbanje bụkwa ofeke mmụọ. Ọ bụ mmụọ na-ata ndị mmụrụ ya ahụhụ. Dịka ka omenala siri kọwa mmụọ a na-ama ụma nwụrụ ma o ruo oge ọchọrọ ị nwụ. CHI-ukwu O teela ndị Igbo na-efe mmụọ akpọrọ 'Chi'. Ọ bụ chi nke ha kwenyere kachasị chi niile ha na-efe. Na nkwenye ndị Igbo, Chi bụ mmụọ kachasị dị ukwu n'ala Igbo. Igbo nwere nkwenye na Chi bụ nwoke, bụkwa mmụọ nke kere ụwa niile. Ya mere ha na-akpọ ya Chineke maọbụ Chi okike makwa bụrụ onye ga-ekpe ikpe kwụrụọtọ na ngwụcha oge. N'ala Igbo, ha kwenyere na onwebeghi onye jiri anya ya abụọ hụ ya, ya mere onweghị ihe ọbụla akpụrụakpụ a na-eji egosipụta mmụọ nke a dịka ha kpụrụ akpụ. Dịka ndị ụka Krist siri nwe nkwenye na 'Chukwu', ndị Igbo nwekwara nkwenye na 'Chi' bi na mbara igwe (elu), ihe a mere ka ọtụtụ ndekọ nwere nkwenye na Chi nke ndị Igbo na nke ndị ụka Kraist bụ otu mmụọ." afirika-50597416,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50597416,External Borrowing: Ọ bụ atụmatụ ibite ego n'ofesi anyị gbajọrọ ka Buhari wetekwara ọzọ - Shehu Sani,Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigala akwụkwọ atụmatụ n'ụlọomeiwu ka ha nye ya ikike ibite ego na mba ofesi.,"Akwụkwọ a kpọrọ ""2016-2018 external borrowing plan"" bụ nke Buhari zigaburu n'ụlọomeiwu n'afọ 2016 mgbe Bukola Saraki bụ onyeisi ha. Ndị ụlọomeiwu jụrụ itinye aka n'atụmatụ ahụ n'agbanyeghi na ndị obi ọchịchị Buhari bụ 'Federal Executive Council' kwadoro ya. Mana ụnyaahụ ndị ụlọomeiwu nke Ahmad Lawan bụ onyeisi ha gụpụtara atụmatụ a ọzọ n'ụlọomeiwu bụ nke onyeisiala Buhari zitere ya ha. N'akwụkwọ ahụ onyeisiala Buhari sị na ụlọomeiwu nke asatọ tinyere aka n'ụfọdụ atụmatụ ahụ kama na ọ bụghị ha niile. Ọ sịkwa na ọ bụ nke a mere gọọmentị ya arụghị ọrụ ha kwesiri ịrụ dịka ngwụpụta ihe n'ala, ọrụ ugbo, ahụ ike, ọkụ latrik nakwa agụmaakwụkwọ. Kedụ ihe mere ndị ụlọomeiwu jiri jụụ atụmatụ a n'afọ 2016? Shehu Sani bụbu onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Kaduna Central n'aha APC kọwara ihe mere ha ji jụụ ịnabata atụmatụ ahụ n'afọ 2016. Ọ sị n'afo 2015 tupu gọọmentị Buhari abata n'ọchịchị Naịjirịa ji ego dị ijeri dọla iri na nde narị iri atọ na abụọ n'ụgwọ site na mbite ego n'ofesi. N'ime afọ atọ gọọmentị Buhari ritere ụgwọ dị ijeri dọla iri na nde narị iri asaa na asaa. Nke mere ya ijeri dọla iri abụọ na ụma Naịjirịa ji n'ụgwọ. Sani kwuru na ọ bụrụ na ha nyere gọọmentị ohere ibite ijeri dọla atọ ahụ na ego Naịjirịa ga-ejizi n'ụgwọ ga-abụ ijeri dọla iri ise na abụọ. Na ọ bụ n'ihi nke ahụ mere ha ji gbajọọ inye onyeisiala Buhari ikike ibite ego mgbe ahụ. Ncheta Paris Club Sinetọ Sani sị na ọ bụ ịkwụghachị ụgwọ mere ha jiri gbajọọ atụmatụ n'afọ 2016. Ọ sịkwa na ọ dịghị mma ibukwasị ndị Naịjirịa ụdịrị ibu mbute ego a ga-apụta. Maazi Sani kwuputakwara na ọdịghi mma dika onye bụbụ onyeisiala bu Olusegun Obasanjo ịnapụta Naịjirịa n'okwu iji mba ofesi ụgwọ mgbe ọ na-achi mba a alaghachie na ya. Cheta na Obasanjo nwetere ọgbaghara ụgwọ ijeri dọla iri na asatọ n'aka ndị akpọrọ Paris Club n'afọ 2005. Akụkọ ga-amasị gị:" media-52732571,https://www.bbc.com/igbo/media-52732571,Coronavirus: Anyị a ga-amalite ịṅụ vitamin D?,Ị nọ n'ime ụlọ kemgbe etiri iwu onye apụla ezi maka mgbochi nje coronavirus mere na ọtụtụ mmadụ anaghịzị anya anwụ bụ ebe ha sị enweta vitamin D.,"Ndị ọrụahụike ụfọdụ gwara ndị mmadụ ka ha na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ vitamin D Ọ bụ site na ịpụ n'anwụ ka ọtụtụ sị nweta ya bụ vitamin bụ nke anụahụ anyị na-eme ma anyị pụọ n'anwụ. Mana kedụ ihe anyị nwereike ime gbasara ya, kedu uru ọ baara mmadụ? Kedụ ndụmọdụ ha nyere? Agwalaarị ndị bị n'Yurop ka ha malite ịṅụ mkpụrụ ọgwụ vitaminD dị 10 ""micrograms"" kwa ụbọchị malite n'ọnwa ọktoba rụọ Maach 2021, ma ọ bụ mgbe ọbụla maọbụrụ na ha enweghị ohere ịpụ n'ezi. Ndị ọrụ ahụike in Ingland gwara ndị mmadụ ka ha na-aṅụ vitamin D mgbe ọbụla kwa afọ maọbụrụ na: Ndị isi ojii nwekwara ike ha agaghị na-enwetacha nke zuruoke ma ọ bụrụ na ha anaghị apụ ezi. Ndị ọrụ ahụike nke Scotland na nke Welsh gwakwara ndị mmadụ otu ihe ahụ mgbe a sị ha apụla ezi. Sara Stanner nke ""British Nutrition Foundation"" sị ""ịnọ n'ụlọ dịn oke mkpa, mana ọ bụrụ na ụfọdụ n'ime anyị anaghị nweta anwụ ka o kwesiri, anyị kwesiri ị na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ vitamin D"". Kedụ ihe Vitamin D ji dị oke mkpa? Vitamin D dị mkpa na-idozi ahụike eze, ọkpụkpụ nakwa uruanụ. Ụkọ ya n'ahụ nwere ike ibute nkwarụ ọkpa Bekee kpọrọ ""rickets"" n'ụmụaka maọbụ nke ha kpọrọ ""osteomalacia"" n'okenye. Mmụta na-ekwu na vitamin D nwereike ime ka ahụ mmadụ merie ọrịa dịka onyi maọbụ nke Bekee kpọrọ ""flu"" mana e nweghị nkwekọrịta na ọ nwereike ịkwalite nche na-enyere ime ahụ aka nya ọrịa bụ ""immune system' na Bekee - ndị kwe ndị ekwe ka dị na ya bụ ụmụta. Ọ mụ ṅụwa vitamin D gbanyụụ? Mbanụ. Ọ bụ eziokwu na ya bụ ọgwụ dị mma mana ịṅụwazi ya mgbe ọbụla nwere ike ibute ọgbataujie n'ọdịnihu. Ọbụrụ na ịchọọ ịṅụwa vitamin D: Ụmụaka dị agbata afọ 0 rụọ na 10 ekwesighị ịnụ karịa ""micrograms"" 50. Ụmụaka na-erubeghị afọ 12 ekwesighi ịṅụ karịa ""micrograms"" 25. Ndị okenye ekwesighị ịṅụ karịa ""micrograms"" 100 kwa ụbọchị, ihe ị kwesiri ịṅụ bụ micrograms 10 n'ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ndị dọkịnta nwekwara ike ịnyefe ya oke mgbe onye ahụ nwere ụkọ vitamin D n'ahụ ya. Ndị nwere ọrịa imeahụ dịka ọrịa uhie ekwesighị ịṅụ vitamin D otu ọbụla. Ọ nwereike ịgwọ coronavirus? Mbanụ. Onweghị mmụta gosiri na ọnwereike igbochi mmadụ ibute ya bụ ọrịa. Mana ndị ọkachamara na-ekwu na ọ nwekaraike ịnyeaka n'oge a. Mkpụrụọgwụ vitamin D ga-ebulite ahụike onye ụkọ ya dị n'ahụ ṅụrụ ya. Ụfọdụ nchọcha gosiri na coronavirus nwereike imesi onye ọbụla nwere ụkọ vitamin D n'ahụ ike. Mana ndị ahụ e jiri mee ya bụ nchọcha nwekwara ọrịa ndị ọzọ siri ike dịka ọrịa obi bụ nke mere ka o sie ike ịkwekọrịta na ya bụ nchọcha. Ndị ọkammụta na Spen na France nọ n'ọrụ ugbua ịchọpụta ma ọnwere ka vitamin D si enyere ndị bụ nje coronavirus aka. Ọkammụta n'ihe gbasara ahụike n'UK bụ Jon Rhodes sị na Vitamin D nwere ike ịme ka ahụ mmadụ ghara ịza aza ebe ụfọdụ nọchacha ndị ọzọ sị na ọnwereike ịme nche ime ahụ mmadụ ịdaa mba nke nwere ike ịme ka coronavirus ""puo nku"" n'ime ahụ onye bu ya. Nchọpụta a nwereike ịdị mkpa maka ndị coronavirus mesigoro ike na ngụ ha bụ ebe ọbutegoro oke ọzịza Bekee kpọrọ ""cytokine storm"". Mana nchọcha ka na-aga n'ihu gbasara nke a. Ebe ka m ga-esi egote vitamin D? A na-etinye vitamin D na nri ụmụaka A na-ere ya n'ụlọahịa nakwa kemist ụfọdụ. Onyereike ịbụ mkpụrụogwụ vitamin D naanị ya maọbụ nke a gwara ọgwa ya na ""multivitamin"" ndị ọzọ. Ndị ọkachamara sị ka ị ghara igote karịa oke ị chọrọ ka ibe gị were hụ nke ha gotere.. Ngwe ndị ọzọ ana edepụta n'ololo Vitamin D bụ D3. Vitamin D2 na-esi na nrị apụta, ebe vitamin D3 na-esi n'ahụ mmadụ. E nwekwere nke ụmụaka." afirika-56454312,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56454312,Ihe ndị oji egbe na-eme agaghị akwụsị anyị ịrụ ọrụ - Uweojii Anambra,Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ M.B kuryas sị na mwakpo niile ndị oji egbe na-awakpo ha agahị eme ka ha daa mba n'ọrụ.,"O kwuru nke a ma kwee nkwa na ndị uweojii ga-echekwa ndụ na akụnaụba ndị Anambra Steetị. Kuryas dọrọ ndị na-akpa arụ aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ, kwuo na aka ga-akpara ha n'oge na-adịghị anya. Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenganyia wepụtara. Nyere anyị aka chọpụta ndị na-awakpo anyị n'Anambra - Uweojii Tochukwu Ikenganyia bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara akọwarala BBC Igbo etu ndị oji egbe amabeghị ndị ha bu jiri wakpo ma gbuo otu oye uweojii na steeti ahụ na Toozde. Ikenganyia sị na ihe a mere bụ nnukwu ihe metụtara ndi uweojii n'Anambara steeti. Ọ sị; ""Ọ bụ dịka elekere anọ nke ehihe ka ndị wakporo ndị otu anyị nọ mgbakọ ụzọ Ọkacha dị na Neni nke okpuru ọchịchị Anaocha."" Ikenganyia sị na ndị a ji ụgbọala Sienna na ọgba tum tum malitere ịkwa mgbọ dịka ha rutere ebe ndị uweojii ahu nọ arụ ọrụ nchekwa. ""Ndị, omekome gafere 20 ji ụgbọala Sienna atọ na ọgba tum tum na ndị uweojii kwara mgbọ ruo nkeji iri atọ tupu ndị uweojii ndi ọzọ gbata inyere ndị otu aka ndi omekome a were gbaa ọsọ."" Mana, ọ si na ndi uweojii abụọ merụrụ ahụ, nke otu onye n'ime ha mechara nwụọ n'ụlọ ọgwụ. DSP Ikenganyia sị na ya amachabeghị etu mwakpo nke mere na Awkuzu siri mee mana ya ma na ọ bụ ndị agha mmiri ka nke ahụ metụtara. Akụkọ si Awkuzu dị n'okpuru ọchịchị Oyi pụta kọwara na ndị agha mmiri ruur atọ nwụrụ dịka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ha. Mwakpo na-ewete ya nke ole ma ole mere kemgbe ndị mmadụ malitere iwakpo ndị uweojii na ndị agha n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe n'ọnwa Ọktoba nke 2020 dika a na-eme ngagharị iwe EndSars. Mwakpo bukwa akara mwakpo ndị nke mere n'Ọnwa Jenụwarị nakwa Febụwarị n'Anambara, Imo, Abia, nakwa Akwa Ibom. Akara na-abukwarị igbo ndị ọrụ nchekwa na buru ngwa agha ha gbalaga. DSP Ikenganyia rịọrọ ndị Anambara arịrịọ ka ha gbanye ndị uweojii aka n'ukwu ka a hụ na mkpa mkpa kwụsịrị. BBC kpọrọ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na Anambara bụ Don Adinuba mana ọ sị na ya enetebeghi ozi banyere ihe a mere." afirika-48220577,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48220577,Sanusi Lamido Sanusi: Ikike ndị Eze Igbo eruru nke ndị ogbo ha?,"Ụmụ Naijirịa tetara ụra ụbọchị Tọzde, Mee 9, were nụ akụkọ na ụlọomeiwu Kano steeti emeela iwu ọhụrụ nke kewapụtara alaeze anọ n'ime otu dịbu na steeti ahụ nke Lamido Sanusi Lamido bụ isi ya.","Ndị ma ihe ekwe kụrụ kwuru na ọ bụ gọvanọ steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje, bụ onye na-eti egwu ahụ ndị ụlọomeiwu na-agba dịka ha kwuru na ọ chọrọ ịkwachalata Sanusi nku. Mana ọ bụghị naanị na Kano ka ụdịrị ihe a na-eme. Lamido Sanusi Lamido bụ Emir nke Kano N'afọ gara aga, Gọvanọ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi, mere mmadụ iri abụọ na otu eze n'Ibadan iji kwalata eze Ibadan bụ 'Olubadan' nku. Kesaa-kposa chie eze n'Ugwu-Awusa na ala Yoroba, o puru mpi n'ala Igbo. Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara ọdịnala nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu siri kọwaa, ikeri obodo nke a kpọrọ ""autonomous communities"" na Bekee n'alaigbo so n'ihe mere na ndị eze na-achị n'Ọwụwa-Anyanwụ enweghị agba ka ogbo ha ndị ala ọzọ. Ezenka Udochukwu Agbarakwe gwara BBC Igbo na ihe mere na Kano nke bụkwa ihe mere e jiri nwee ""autonomous communities"" na mpaghara ụfọdụ n'Alaigbo, bụ ""ihe ndị na-ebutu ugwu eze."" ""Ọ bụghị ezigbo ihe maka na gidigidi bụ ugwu eze. Ọ bụ ọnụọgụgụ ndị onye eze na-achị nakwa ihe ha na-eme bụ ugwu eze."" Ndị nze na ọzọ ""Ọ bụ ihe mere na eze ndị Igbo enweghị nsọpụrụ dịka Ooni nke Ife, Emir nke Kano na Shehu nke Borno."" Ọ rụtụrụ aka na ""n'Imo steeti, e nwere ""autonomous communities"" dị narị anọ. Gọvanọ Rochas nwere ọtụtụ ""autonomous communities"" a o kewapụtara n'oge ọchịchị ya."" Larry Oguego rụrụ aka na ọ bụ n' Imo, Abịa na Enugwu steeti ka ndị ọchịchị kachasị kesasịa obodo ma nye ha eze nke ha. O kwuru na nke a bụ iji tinye ha n'akpa, ""ka ha nwee ike were ndị ahụ were rụọ ọrụ n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị."" Gidigidi bụ ugwu eze Oguego katọkwara atụmatụ ahụ sị, ""e nweghị uru dị ya makana ụdịrị ndị a na-etinye abụghị ndị kwesịrị ịbụ igwe."" ""Ọ na-ebute nkewa. Gọọmentị na-emefukwa ego ịkwụ ha ụgwọ ọnwa nakwa ịzụrụ ha ụgbọala."" Ọ gara n'ihu kwuo na o mere ka ""Igwe karịa ndị ha na-achị."" ""O kwesịrị na Igwe ga-enwe ugwu mana ugbua igwe bụ ịtọ kọbọ."" Mana Ifeanyị Onah kwuru na ikerisi obodo ma nye ha igwe na-ebute mmepe obodo. ""Ọ na-eme ka ọchịchị rue ndị a na-achị nso."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52998279,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52998279,Abịa state Roads: Ụkọchukwu edurula ndị ụka mee ngagharịiwe maka ajọ okporoụzọ n' Aba,"Ụkọchukwu na-achịkọta ụka Metọdist nke 'Ụmụogele Circuit' dị na dayọsis Aba-East bụ Acha David Okechukwu, edurula ndị ụka ya gaa mee mbeku maka ajọ ọnọdụ okporoụzọ dị n'Aba, Abia.","Okechukwu Acha na ndị ụka ya oge ha gara n'okporoụzọ Ohanku Okechukwu, onye ji akwukwọ nso na abụ na ekpere zọchie n'okporoụzọ Ohanku, dị na Ngwa Road, Aba, ụbọchị Satọdee dọtara anya ọtụtụ ndị na-agafe dịka ọ gara ije n'ime idemmiri dọ n'okporoụzọ ahụ. Okporoụzọ Ohanku bụ ụzọ jikọrọ ebe dị icheiche n'ala Igbo gụnyere Rivas steeti, Akwa-Ibom, Aba-Saụt na Aba-Nọt. Ihe ha mere bidoro wuwe na soshal midia n'ụbọchị Wednesde, Juun 10, dịka ọtụtụ ndị mmadụ ji ọnọdụ okporoụzọ dị n'Aba were mee isi akụkọ. Ụkọchukwu Okechukwu Acha banyere ọdọmmiri nọ n'okporoụzọ Ohanku, dị n'Aba Mana Ụkọchukwu Acha gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụghị ngagharịiwe ka ha mere, kama na ha gara kpọkuo Chineke ka o zitere ha onye ga-arụ okporoụzọ ahụ dịka ọnọdụ ya na-ata ndị na-azụ ahịa nakwa ndị bi na mpaghara ahụ ahụhụ. Ọ sị, ""Isi okwu anyị bụ Chineke napụta anyị, onye ọbụla ụzọ ahụ dị n'aka, metụ onye ahụ aka n'obi ka ọ bịa."" Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na ajọ ọnọdụ okporoụzọ Ohanku na-adọghachi aka elekere azụ n' atụmatụ dayosis ya nwere iwulite ụlọọgwụ na mpaghara ahụ. Gee ihe o kwuru n'uju: 'Ngwa ngwa a rụrụ ụzọ , aga enwe mmepe akụnaụba' South -East Roads: Ndị njem atọla n'Ugwuoba n'ihi ọjọọ Ọnọdụ ọtụtụ okporoụzọ dị n'ala Igbo bụ ihe na-eri ọtụtụ ndị Igbo nri n'afọ kemgbe ọchịchị gafere n'aka ndị nkiti n'afọ 1999. Ụkọchukwu Okechukwu Acha na ndị ụka ya Cheta na n'afọ 2016, otu ụkọchukwu Angịlịkan bụ ụkọchukwu Uche Chinamerem, mere emume ncheta nnwereonwe Naijiria n'okporoụzọ 'Douglas Road' dị n'Owere, iji gosi ajọ ọnọdụ ụzọ ahụ nke ghọrọ ikpo ahịha oge ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 42941625,https://www.bbc.com/igbo/42941625,Nwunye dibia Boko Haram achịliele aka elu nye ndị agha,Onye bụ nwunye dibia na-ahụ maka ahụike onyeisi otu Boko Haram bụ Rabi Abu-Yasir chiliri ndị agha Naịjirịa aka elu ụbọchị Satodee abalị atọ nke ọnwa Febuwarị dịka ha naebu agha a na-akpọ Lafia Dole.,"Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kamgbe afọ 2015. Onye nchịkwa agha Lafia Dole bụ Major General Rogers Nicholas kwupụtara nke a oge o nyefere ụmụnwaanyị na ụmụaka dị mmadụ iri asatọ na abụọ ha gbapụtara n'aka ndị Boko Haram ma nyefee ha n'aka ndị ọrụ nchekwa na Borno steti. Rabi gwara ndị ntaakụkọ na di ya bụ dibia na-elebanye anya n'ahụike onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau. O kwuru na a gbapụtara ya ụbọchị Fraide dịka ndị agha Naịjirịa chụpụrụ ndị Boko Haram nọ nime ọhịa Sambisa. Dịka ọ na-ekwupụta ka ya na ihe si gaa, Rabi kwuru na ọ masịrị ya etu esi na eledo ya anya maka ọkwa ọ nọ dịka nwunye dibia Shekau. N'okwu ya, ""Dị m, abu-Yasirbụ dibia Shekau, ọ na-eledokwa ndị ọzọ ahụ na-adịghị ma na-emekwa iwe ahụ."" Etu esi eme m Rabi dịka nwunye dibia Shekau ""Ụdị nri m na-eri dị iche n'ihe a na-enye ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị ọzọ nọ n'ogige ahụ."" Anyị tara ahụhụ n'aka ha, ha dọkwara anyị aka na ntị na ndị agha Naịjirịa ga-egbu onye ọbụla nyefere onwe ya n'aka ha."" Ana chosi Shekau ike na Naịjirịa ugbua. ""Ha gwara anyị oge ọbụla ka anyị nọnyere ha ma rube isi nye ndị otu ha, mana ndị agha Naịjirịa na-eledo anyị anya na-abụghị ihe ndị Boko Haram gwara nyị."" Rabi toro ndị agha Naịjirịa maka mgbapụta agbapụtara ha ebe ọ kpọkuru ndị a tọrọatọ bụ ndịka nọ nime ọhịa ka ha pụta bịa nyefee onwe ha n'aka ndị agha. Nichola bụ onye nchịkọta agha Lafia Dole kọwara na Rabi sọ na mmadụ iri asatọ na anọ ndị agha gbapụtara. O kwuru na mmadụ asatọ nime mmadụ iri asatọ na anọ ahụ agbapụtara na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ndị agha elu Naịjirịa. Onye nchịkota ahụ kwuru na ndị ahụ a tọrọ na-agabiga ntaramahụhụ di egwu n'aka ndị Boko Haram. Nicholas mere ka a mata na a gbapụtara ndị ahụ site n'aka ndị Boko Haram,chụpụb ha ma nọchie isioche Shekau dị n'ọhịa Sambisa." afirika-43128529,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43128529,Ọkaiwu Binta Nyako Adọtịala ikpe ndị Ipob,"N'ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja, ọkaiwu Binta Nyako dọtiri ikpe ndị otu Ipob ebidoro kamgbe 2015.","Ndị Ipob na-achọ ka ekwa Naịjirịa Akụkọ sitere n'aka Emma Powerful bụ onye na-ekwuchitere ndị Ipob na-akọwa na ọ bụ onye ọkaikpe sinetọ na-anọchite anya ndị Abia Saụt Sinetọrịal bụ Enyinnaya Abaribe, tinyere akwụkwọ ka-adọtia ikpe a. Mana onye ntaakụkọ nọ n'ụlọikpe a gwara BBC Igbo na ọ bụ ọkaikpe nke gọọmenti Naịjirịa sị ka ọkaiwu Nyako wepu okwu Nnamdi Kanu site n'ime nke ndị otu ya. Onye ntaakụkọ gwara anyị na ọkaiwu kwetere, wee dọtịa ikpe a, weruo ya ụbọchi 20 na 22 n'onwa Maachị nke afọ a. Cheta na Benjamin Madubugwu, David Nwawuisi, Bright Chimezie Ishinwa, Chidiebere Onwudiwe na ndị ọzọ na-aza azịza maka ebubo gọọmenti Naịjirịa boro ha maka nkewa ha sị ka-ekewa Naịjirịa wee nye ha mba Biafra. Powerful na-atụ aka na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa mere ihe e ji dọtịa ikpe a, ma na a na-asị na ọ bụ ha mere ka Sinetọ Abaribe chọọ ndọtị ikpe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-48509914,https://www.bbc.com/igbo/media-48509914,Luka Jovic: Real Madrid azụọla Luka Jovic ebe ego bere,Otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid na mba Spain eburula nde kwuru nde yuros gaa zuta nwata nwokorobia a na-akpọ Luka Jovic.,"Jovic di nani iri afọ abụọ na otu Jovic bu onye si mba Serbia nọbu otu egwuregwu Eintracht Frankfurt dị na mba Germany, mana akụkọ na-ekwu na Real Madrid ekwetala ịkwụ ihe kariri nde pound iri ise ( £50m) i ji zụrụ ya. Real Madrid kwetakwara na ha ga na-akwụ Jovic nde Euro asatọ na ụma (£8.7m) kwa afo wee ruo afọ isii ya bu nkwekorịta ga abịa n'isi njedebe. Madrid ga-akwụkwa. End of Twitter post, 1 Aka na-elekota Real Madrid bu Zinedine Zidan ekwubuolarị na ọ ga-azụta ọtụtụ ndi ọgba bọọlu ọhuụrụ iji wee wulite otu ya, tụmadi ka ha gbachara ọnyụpa na agba futbọl nke gara aga. A na-atụ anya na Real Madrid ga-azukwa onye otu futbọl Chelsea a na-akpọ Eden Hazard n'oge na-adịghị anya. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: @omoissyy tinyere ihe ịkpa ọchịna-ekwu na Jovic ga-elelị Bale na Benzema. @Blue_Footy anaghị akwado otu egwuregwu ọbụla na Spain mana ugbua m ga-ebido na akwado Real Madrid. @Mrhappy1998 kwuru na oge ọgwụgwụ oge eruola afọ iri na otu ha na Bezema. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50280657,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50280657,Bobrisky: Njem m isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma,Idris Okuneye ama ama dịka Bobrisky edepụtala n'elu Instagram ya na njem ya isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma.,"Bobrisky sị na njem a riri ya ego ruru nde kwuru nde, na ọ dịla anya ọ malịtere ịwa ahụ maka nke a mana o nweghi onye ọ chọrọ ka ọ mara makana ike asịrị adịghị ya. O depụtakwara na ọ ka ga-awa ahụ dị ịche ịche ọzọ nke bụ na tupu oge a rue n'afọ na-abịanụ ọ ga-azọ ọkwa nwaaanyị makarisirinụ n'ụwa. End of Instagram post, 1 Mana lee ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu n'elu soshal midia maka ihe a Bobrisky depụtara mere o ji na-ewu na Twitter. @puffykike na-akwado Bobrisky ma na-agwa ya na onweghi ihe dị njọ n'ihe ọ na-eme n'ihi na ọ bụ ihe masiri ya. @obaino_jay na-ajụ Bobrisky ajụjụ ma ọ hụwala nsọ ya? @NixiLady na-atụ alo ka Bobrisky zawazia aha nwaanyị. Ihe ise ikwesiri ị ma maka Bobrisky Akụkọ ndị ga-amasị gị Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye" 45231531,https://www.bbc.com/igbo/45231531,Kofi Annan: Ihe asaa ị maghị maka Dike Afrịka,"Kofi Annan, onye chịburu otu mbaụwa a kpọrọ 'United Nations' (UN), ma bụrụkwa okpeudo a ma ama na mbaụwa, nwụrụ taa bụ Satọde, Ọgọst 18.","Ndị ndu mba dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu na-ekwupụta obi mwute ha maka ọnwụ ya, ma na-ebunye ezinaụlọ ya ụkpa ekele maka ezi ọrụ niile ọ rụrụ n'ụwa tupu ọ laa mụọ. Lee ihe ndị ị maghị maka dịke Afrịka ji eje mba: 1. Ọ bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị dịka ọnyeisi UN. Ọchịchị ya sochiri nke Boutros Boutros-Ghali, onye Afrịka chịrị UN naanị agba mbụ, ma chịa agba abụọ bụ afọ ise, afọ ise. Kofi Annan, bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị 'United Nations' 2. Ọ bụ ejima. Ejima nwanne ya nwanyị bụ Efua nwụrụ n'afọ 1991. 3. O ritere nturuugo 'Nobel' nke ya na otu UN so nweta n'afọ 2001 maka nhazi o mere n'otu ahụ dịka otu na-akpa udo. 4. Nwaanyị mbụ ọ lụrụ bụ onye Naijiria, nwaada Yoruba a kpọrọ, Titi Alakija. Ha mụtara ụmụ abụọ; nwaanyi, Ama na nwoke, Kojo. Mana ha gbasara n'afọ 1983 ka afọ iri na asatọ gachara. Ọ lụrụ onyeọcha, Nane, onye mba Swiden. 5. O nwere otu ọkwọ ụgbọala bụkwa onye ya na ya bụ 'ahụghị na erighị' rue Ọgọstụ 18, 2018, ụbọchị ọ nwụrụ. 6. Kofi Annan bụ onyeisi otu 'Elders' otu na-agba mbọ maka udo na ikike dịrị onye nke Nelson Mandela hibere. Kofi Annan bụ onyeisi otu 'Elders' nke Mandela hibere 7. Agbanyeghị na Kofi Annan bụ dike e ji aha ya a ga mba, o nwere ebe o si rie mperi mgbe ọ dị ndụ. A na-arụ ya aka maka ọtụtụ ndị mmadụ tufuru ndụ ha n'Agha Rwanda. E kwuru na o gburu oge inye iwu ka ndị agha udo nweta ngwaọgụ n'agha ahụ riri mmadụ ruru 800,000. Kofi Annan kwuru na ọ tara ọnwe ya ụta ịkpụ ụkwụ n'ala n'okwu gbasara Agha Rwanda Ihe ọzọ ndị mmadụ tara ya ụta bụ nzọ ụkwụ ya n'ebubo e boro otu onye welitara isi n'ụlọọrụ UN a kpọrọ Ruud Lubbers. E boro Ludder ebubo mmekpaahụ ụmụnwaanyị ya na ha na-arụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47085524,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47085524,International Criminal Court: Ụlọikpe mbaụwa atọhapụla Laurent Gbagbo,Akụkọ dị mkpa: Ụlọikpe Hague atọhapụ Laurent Gbagbo,"Ụlọikpe mbaụwa dị na Hague enyela iwu ka atọhapụ onye chịburu mba Ivory Coast bụ Laurent Gbagbo. Nke a na-abịa ka ọ gachara izụka abụọ e kpebiri n'ikpe amaghị ya n'ebubo mpụ megidere mmadụ e boro ya. Ndị mmadụ tubọrọ ebe nhọpụta maka Big Brother Naija Ndị bịara mmemme nhọpụta BB Naija Akụkọ na-erute anyị nti kwuru na ndị mmadụ a mabeghị ole ha dị merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ tụbọrọ, dịka ndị ntorobia pụtara n'igwe ebe a na-emem nhọpụta maka emume Big Brother Naija agba nke 2019 na steeti ndị e hiwere ya ụbọchị Fraide. A katọọla ọbịbịa ndị gọvanọ si mba Nijie bịara ikwado Buhari n'achụmnta vootu ya Gọvanọ Ganduje na ndị gọvanọ si Niger Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mba na mba, bụ Sam Olisa, akatọọla ọbịbịa ndị gọvanọ abụọ si mba Niger bịara Naijira maka achụmta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari. Olisa gwara BBC Igbo na nke na-egosi na Naijiria enweghị ezi nchekwa agbata ya na ndị mba ọzọ nakwa agaghị enwe ntụliaka kwụ ọtọ. Amerika na-atụ uche maka ọnọdụ ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria Onye nnochite anya mba Amerika Naijiria bụ Stuart Syminton ekwuola na na mba ahụ na tu uche maka ochichị onyekwuouche ya na Naijiria. Syminton kwuru nke oge ọ gara ileta onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu n'Abuja. ụbọchị Fraide. Aha ndị ga-azọ ọchịchị apụtala Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ewepụtala aha ndị ga-azọ ọkwa dị iche iche na ntuliaka nke 2019. Aha gunyere ndị na-azọ ọkwa gọvanọ, omeiwu nke steeti nakwa nke Naijirịa gburuguru. Pati nọ n'ọchịchị bụ APC enweghị onye nnọchịte anya na Zamfara na Rivers steeti. Boko Haram wakporo ndịagha Ọdachị jekwuru ndịagha Naịjirịa na mpaghara obodo Dikwa di na Borno steeti ụbọchị Wenesde. Onye agha ma maka ihe a gwara ulo ntaakụkọ AFP na ndị Boko Haram wakporo ndịagha ka ha si ihu agha ala ma gbuo mmadu asaa n'ime ha. Emechara chọọ ndị omekome a ọsọ. N'ofesi, Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ Onye na-anọchịte anya mba Amerịka na Nọt Korea bụ Stephen Biegun ekwuola na ha ekwela nkwa imebi ụlọ mmepụta akụrụmgwa Nuclear ha. Biegun si na ọ bụ onye na-ekwuru Amerịka n'ihe banyere mmekọ ha n'ụwa dum bụ Mike Pompeo natara nkwa ahụ n'aka ndị Nọt Korea. N'egwuregwu, Ego eji atumgbere ndị egwuregwu bọọlụ adaala. N'oge a n'afọ gara aga nde pum nari anọ na iri atọ anala n'akpa ndị mmadụ, mana ọ bụ nde pum otu nari na iri asatọ ka enwetara. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Okwu Paul Achalla banyere referendum" afirika-49666503,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49666503,VAT to 7.2%: Etụ Naijirịa si nabata mbuli ụgwọ VAT na soshal midia,"Gọọmentị etiti amanyela mbuli ụgwọ ụtụ isi a na-atụ n'ahịa azụrụ nke Bekee kpọrọ 'Value added tax,' VAT n'aha ịchafụ n'ụbọchị Wenezde.","Ọnọdọ ọhụrụ ụgwọ ahụ nọzi na ya bụ pasentị 7.2 site na pasentị 5 ọ bụ na mbụ. Nke a emeela n'ụfọdụ ụmụ Naịjirịa malitere igosi iwe ha nakwa ịkatọ gọọmentị etiti n'elu soshal midia. Iji ma atụ, Wale Adetona na-ekwu na gọọmentị etiti akwụbeghị ụgwọ opekata mpe na-amanye ego ụtụisi. End of Twitter post, 1 Musty Barde kwenyere na ihe Adetona kwuru Pecky kwukwara na mbuli a agaghị adịrị ndị na-azụ ahịa mma Olawale kwuru na Gọọmentị etiti kwesiri ịpụta kọwara ndị mmadụ etu mbuli a ga-esi bara Naịjirịa uru. Kator kwuru na ọ bụ ihe ihere na gọọmentị etiti chọrọ ibuli ụgwọ VAT ebe ha amanyebeghị mbuli ụgwọ ezumike nka. Mana Minista na-ahụ maka nhazi na mmefu ego bụ Zainab Ahmed kọwara na ego ga-apụta na ya bụ mbuli ga-enye aka wulite akpaego obodo. O kwukwara na a ga-ebu ụzọ nyocha iwu gbasara VAT ahụ tupu ha amanye mbuli pasentị 7.2 dịka gọọmentị si kwado. Ihe nkiri Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi Akụkọ ndị ga-amasị" afirika-48819535,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48819535,US-North Korea: Trump agaala ije na ndagwuru ugwu olulu ọnwụ,Donald Trump abụrụla onyeisiala mba Amerịka mbụ nọ n'ọchịchị ga-aba na mba Saụt Korịa mgbe o zutere Kim Jong-un n'agbata obi Nọt na Saụt Korea.,"Trump na ogbo ya nke Nọt Korịa kwere n'aka tupu ha e kwuo okwu n'ihe ruru otu awa n'ime agbagha bụ 'Demilitarized zone' na Bekee. Mba abụọ ndi kpebiri ihiwe otu ga-amalite mkparịta ụka ọzọ banyere ngwaagha nuklịa nke kwụsịrịla ọtụtụ ọnwa. Nzuko ha abụọ mere banyere ngwaagha nuklịa kwụsịrị n'ọnwa Febụwarị. Trump na Kim na-ekwe n'aka n'akụkụ ndị Nọt Korịa nke agbataobi ha na ndị Saụt Kọrịa Ndị nkatọọ kwuru na nzụkọ a bụ nke ugboro atọ ga-adị n'etiti ndị isi abụọ a bụ amansị a na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha kwuru na Nọt Korịa ka kwesiri igosi na ha adịla njikere ịkwụsị nrụpụta ngwaagha nuklịa. Trump na Kin nọ n'ime agbaagha (DMZ) Nzuko a dịka ha mere mgbe Trump kpọrọ Kim oku site n'akara Twitter ya n'ụbọchị Satọde, ha na-ekwe n'aka dịka ha kwụ n'ahịrị kewara mba Korịa abụọ ndị a. N'atugughi oge, Trump gafere ma banye na Nọt Korịa, iji mee akụkọ a dara ụda. ""Ọ dị mma ịhụ gị ọzọ. atụghị m anya izute gị ebe a,"" Ihe Kim gwara Trump site n'ọnụ onye ntapịa na nzuko a gbara n'igwe TV mbaụwa. ""Nnukwu oge"" dịka Trump zaara, ""Nnukwu ọganihu."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49313396,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49313396,Arsenal vs Newcastle: Arsenal ewerela 'chizoba' zaa aha nna ha,"Ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal, esorola ndị Manchester City, Liverpool nakwa Tottenham were gbaa aka ahịa na afọ EPL ọhụrụ.","Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu na nkeji 58. Arsenal gbalịrị zaa aha nna ha site n'iji otu ọkpụ goolu merie Newcastle taa. Mana mmeri ahụ akpụghị ọkụ n'ọnụ n'ihi na ha achakeghi ka ọnwa ma ncha. Aubamenyang bụ onye nyere otu goolu ahụ ha ji gbaa aka ahịa na nkeji iri ise na asatọ. Pierre-Emerick Aubameyang Lịka lịka niile ndị Newcastlke gbara iji saa otu goolu ahụ amịtaghị mkpụrụ. Mmeri a ga-atọ Unai Emery, onye nkụzi ndị Arsenal ụtọ maka na ọtụtụ n'ime ndị Arsenal jiri biri esoghi sọọ mpi nke taa. Ana m egosi ụwa na ndị Naịjirịa abụghị ndị ohi - Kelechi Arsenal Mmadụ dị ka Alexandre Lacasete nakwa David Luis bu onye e si Chelsea zụta abalị ole na ole gara aga anọghị n'egwu taa. Ọzọkwa, Pepe, bụ onye Arsenal si Lille na France zụta, esoghi bido bọọlụ taa, kama e tinyere ya etinye na nkeji iri asaa na otu. Leicester na Wolves agbaghị aka ahịa. N'aka nke ọzọ, onweghi onye meriri na asọmpi nke dị n'etiti Leicester na Wolves. Ha abụọ gbara onwe ha onye lawa onye lawa. Anya niile nọzị na ama egwuregwu 'Old Trafford' ebe ndị Manchester United ga-ezute ndị Chelsea. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ" afirika-48421399,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48421399,Muhammadu Buhari: Ndị kpọrọ m 'Baba-go-slow slow' bịa hụrụ m na-agba nke abụọ,Onyeisiala Buhari ekwuola na Bukola Saraki na Yakubu Dogara megidere onwe ha site na etu ha si jide bọjeti ruo ọnwa asaa tupu ha ewepụta ya.,"Onyeisiala Muhammadu Buhari ji aha pati APC azọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 Buahri kwuru nke mgbe ọ na-aza onye ntaakụkọ NTA ajụjụ ọnụ gbasara etu ọ ga-esi me ihe dị iche n agba nke abụọ ọchịchị ya dịka onyeisiala Naịjiịa. O jikwa ohere ahụ kwuo na ọ ga-agba mbọ hụ na ndị uweojii na ndị ọkaiwu rụrụ ọrụ ha ọfụma, Ọ rịọrịọ ndị Naịjirịa ka ha gba ndị omekome nọ n'agbataobi ha n'anwụ ka obodo naịjirịa nweike ịdọbata ndị oji ego achụ ego si mba ofesi. Ihe ndị ọzọ kwuru na mkparịtaụka a: Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia @AkinbolaRoqeeb toro onyeisiala etu o si wepụta aka ọhụrụ maka ndị uweojii na ndị ọkaiwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48245974,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48245974,Premier League title: Man City amaburula iko mere Liverpool ọnọ nso eru aka,Manchester city emeriela English Premier League nke izu 2018/2019 dịka ha merichara Brighton na Hove Albion ọkpụ anọ asatara otu.,"City gbagoro n'ogo nke mbụ tebulu Premier League dịka ha ji otu pointi gafee Liverpool n'ọzị n'ogo abụọ. Nke a ga-eme ya mmerị anọ nturu ugo Premier League Man city na-enweta kamgbe afọ 1992. Ha bụkwa otu egwuregwu merigoro n'usoro n'usoro ọkwa Premier League kamgbe afọ iri gafechara. Ilkay Gundogan,Riyad Mahrez,Aymeric Laporte nakwa Sergio Aguero nyere goolu anọ ndị Mancity ji merie Brighton bụ otu bụ ụzọ nye goolu. Mmeri mekwara ka Liverpool bụrụ na-ele anya ma ha ga-enweta ya bụ ọkwa n'izu ọzọ na-abịanụ dịka ha ji ọkpụ abụọ asataghị otu merie Wolves. Iko premier League akwaala Liverpool nke afọ 29. Ikuku Man Utd amaala n'ọnya Cardiff Manchester bụ enyi ama ama azọpụtaghị onwe ha n'aka Cardiff dịka ha gbara ha ọkpụ goolu abụọ asataghị otu. Nathaniel Mendez-Laing pianyere goolu abụọ nyere Cardfiff mmeri ebe onye nche goolu Cardiff bụ Neil Etheridge gosiri na ọ bụ dike site n'igbochi goolu niile ndị United gbara mbọ inye. Otu Arsenal nwakwara oke ha site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie Burnley . Chelsea na Leicester mara aka mana o nweghị onye nyere ibe ya ọkpụ goolu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 44340801,https://www.bbc.com/igbo/44340801,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru na ha mara Ingland nke ọma,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Nnukwu ụgbọala akwọriela nwaanyị ku nwa na mmadụ isii ndị ọzọ n'Owerri Ọ bụghị ụgbọala ka mgberede a mere Otu nwaanyị ku nwa n'aka na mmadụ isii ndị ọzọ etufuola ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Owerri. Ndị ọrụ nchekwa FRSC kwuru na nchọpụta ha na-atụ onye kwọ nnukwu ụgbọala kụrụ ụgbọala mmadụ iri na isii si Ọnịcha nọ n'ime ya. Naịjirịa Ndị ọchịehi a ga-abụ otu na-eyi ọha egwu ka ha agahị abụ? Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa Ụlọikpe etiti nọ n'Abuja ga-amalite ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juunu ileba anya ka a ga-akpọ ndị ọchịehi otu na-eyi ọha egwu. Ọ ga-elebakwa anya n'akwụkwọ e degara ya ka ha kwụsị ndị ọchịehi ịchụ ehi na Benue steeti maka mkpamkpa ha na-akpa eba ahụ. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ọgbaghara mere n'APC Ekiti steeti chọrọ ịta isi Fayemi. Otu APC ekwuola na ọgbaghara mere n'Ekiti bụ onye bụbu gọvanọ steeti ahụ bụ Kayode Fayemi ka a chọrọ igbu. Fayemi hapụrụ ọkwa ya dịka mịnịsịta na-ahụ maka ngwụputa ịga zọọ gaọvanọ ọzọ n'Ekiti. Akụkọ mba ofesi Kenya chọrọ ịhụ na ndị ọrụ ha niile bụ ndị na-ekwu eziokwu. Uhuru Kenyatta kwere nkwa ịchụ mpụ oge o meriri ntuliaka n'afọ 2013 Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta ekwuola na ndị na-achọ ọkwa ọchịchị na gọọmenti ya ga-agafe mashine na-enyocha asị. Kenyatta kwuru na nke a bụ iji nyochaa ndị ọrụ ha maa chụkwa mpụ ọsọ. N'egwuregwu, Naịjirịa na Ingland ga-akwata ya na ọgbọ Wembley taa. Dịka Naịjirịa na Igland ga-agba asọmpi enyi na enyi taa, Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru ka a wụsara ha ọwara maka ya bụ asọmpi. Ha kwuru na nke a bụ maka na ha mara mba Ingland nkeọma ebe Mikel gbaburu Chelsea ma Iheanacho na-agbara Leicestere City bọọlụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Lee etu ndị APC ji kataka were gbasaa ntuli aka ha n’Enugwu" afirika-49984171,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984171,Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu,Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nta si ọwụwa anyanwụ akpọkuola Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o tinye ọnụ n'okwu gbasara ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.,"Gọọmentị etiti mechiri ọdọụgbọelu a n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst, 2019, maka ịrụ ọrụ n'okporoụzọ ebe ụgbọelu na-agba dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ bụ Henrietta Yakubu si kwuo. Obi adịghị ha mma etu e si kpọchie ọdọụgbọelu ahụ kamgbe izuuka isii gara aga, na-enweghị ọrụ ọbụla a na-arụ na ya. N'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Wenezdee, ndị omeiwu a kpọrọ oku ka e mee ngwa ngwa dozie ọdọụgbọelu ahụ. Ndị binyere aka n'akwụkwọ ahụ gụnyere Toby Okechukwu, Nkeiruka Onyejocha, Pat Oziokoja, Ofor Chukwuegbo na Amadi Dennis. Ndị ọzọ gunyere Oke Martins, Nnaji Cornelius, Simeon Atigwe, Blessing Onuh, Uko Nkole, Darlington Nwokocha, Valentine Ayika, Francis Agbo na Benjamin Mzondu. Nkeiruka Onyejeọcha Ndị omeiwu ahụ gosiri mwute na kamgbe e mechiri ọdọụgbọelu ahụ, onwebeghị ndị e nyere ọrụ idozi ya. Ha kwukwara na ọdọụgbọelu ahụ bu nke dịkarịsịrị mkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ nile. Ha kpọkukwara ngalaba na-ahụ maka ịrụ ụzọ ka ha mee ngwangwa imezi ụzọ ndị dị n'ala Igbo iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'ụzọ. Cheta na gọọmentị etiti mechiri ụdọụgbọelu Akanu Ibiam kemgbe ọnwa Ọgọst maka nrụgharị ya maka onwebeghị onye ọrụ ahụru ebe ahụ maka ya bụ atụmatụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ" afirika-51572067,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51572067,Anyị anọrọla n'ime ụlọ ruo izuụka atọ na Chaịna maka Coronavirus,Chukwuma Nzube na-agụ mahadum na Wuhan dị na Chaina bụ ebe nje coronavirus na-akpọtụ.,"Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ gọọmentị Chaịna na-enye ha nri ugboro atọ kwa ụbọchị, ma na-enyekwa ha ihe ndi ọzọ eji ijikọta ndụ. Mana nwa amadị a si na nke kachasị ewe iwe bụ na ndị Naịjirịa agwabeghi ha okwu ọbụla. Maazị Nzube si na ihe ha chọrọ ugbua bụ ka enya ha ohere ịlọta Naijirịa dịka ndị si mba ndị ọzọ na-eme. Lee ihe ndị ọzọ okwuru na ihe nkiri a." afirika-44221786,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44221786,Buhari : Ndị omeiwu Naịjirịa bụ ndị umengwụ,"Okwu onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọtụtụ ndị omeiwu na-anara ego na-arụghị ọrụ ọbụla, nwere ike ikpasu ụfọdụ ndị mmadụ iwe.","Muhammadu Buhari kwuru na ọ ga-azọ ọchịchị n'afọ 2019 Ka Buhari na ndị otu na-akwado ya bụ 'Buhari Support Organisation (BSO)' zukọrọ n'Abuja, o kwuru ọtụtụ ihe nke gụnyere na ndị omeiwu na-egbu oge na-agbanyeghị na ụfọdụ n'ime ha anọruola afọ iri n'ụlọ omeiwu. End of Twitter post, 1 O kwuru; ""bọjeetị afọ a na nke afọ gara aga m wegara n'ụlọ omeiwu bụ nke kachasị na mmapụta akụ e ji arụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ; ọ karịrị naịra otu tari na nde atọ (1.3trillion)."" ""Ka onye ọbụla pụta bịa maa m aka n'ihu ọha n'ụlọ omeiwu. Gịnị ka ha na-eme kemgbe? Ụfọdụ n'ime ha anọọla ebe ahụ afọ iri. Gịnị ka ha na-eme kemgbe? Ya mere, n'ezie, ebe o si ka mma bụ na ekwuru m ya na anyị enweghị mba ọzọ na-abụghị Naịjirịa."" Buhari metụkwara aka n'ihe gbasara nde dọla iri isii nke ndị chịbụrụ Naịjirịa kwuru na ha tinyere n'ọkụ: Mana oge anyị kpọrọ otu onye omeiwu n'ekwentị bụ Mao Ohuabụnwa, o kwuru na ya achọghị ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49759980,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49759980,Yemi Osinbajo: Ihe kpatara osote onyeisiala ji ewu na soshal midia,Oche 'barber' bụ oche na-adịkarị ebe a na-akpụ isi.,"Osote onyeisiala Yemi Osinbajo Ọ bụ ụdị oche na-eme ntụgharị nke bụ n' ebe ọbụla onye na-akpụ isi tụgharịrị ya ka ọ na-eche ihu. Ihe na-ewu ebe niile ugbua bụ na ọ bụ otu ahụ ka oche osote onyeisiala Naịjiria bụ Yemi Osinbajo dị ugbua. Ụfọdụ sị na ọ bụ naanị aha ka Osibanjo na-aza dịka osote onyeisiala, na o nweghị ikike ọbụla nke aka ya. Mana Ọgbakọ 'National Economic Council' e mere n'obi gọọmentị etiti n'ụbọchị Tọọzde bụ Osinbajo nọ n'isioche. Ndị na-eso n'ọgbakọ NEC bụ ndị gọvanọ niile, onyeisi ụlọakụ etiti, nakwa ndị ọzọ welitere isi. Nke a mere ka ndị mmadụ malitekwa tinyewe ọnụ n'okwu ahụ. @onyebuchind gwara ndị asịrị ka ha mịba mma ha n'ọbọ. @nnaji_kate sị ndị ọsụkọsụ nwamkpi ha dere jụụ. Mana ụfọdụ ka na-ekwukwa na Osinbajo enweghịzi ikike ọbụla dịka osote onyeisiala. @YoungOtutu kwuru na a napụla Osinbajọ ikike nile o jibu. Mana ihe Young Otutu kwuru abụghị eziokwu n'ihi na Osinbajo ka jikwa ọkwa onyeisioche ngalaba niile ahụ ọ kpọrọ aha. @BolanleCole kwukwara na Buhari agbapụla ndị niile nyeere ya aka ịbata n'ọchịchị n'ụzọ. @dejiadeyanju kwuru na ihe nwere ike ịka njọ nye Onyeisiala. Gịnị kpatara Osinbajo ji wube na 'Twitter'? Osote onyeisiala Yemi Osinbajo Ọ malitere mgbe ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ dere ọtụtụ akụkọ gbasara ọnọdụ osote onyeisiala. Ufọdụ kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka Osinbajo nata ya ikike tupu ngalaba ọbụla ọ na-elekọta emee ihe ọbụla. Ndị ọzọ kwuru na e nwere otu ndi ogwoogwo ọnụ a kpọrọ 'Cabal' na bekee ndị na-agbọ mbọ ịhụ ụzọ ha ga-esi kwatuo Osinbajo. Otu jikọrọ ndị Yoruba kwukwara na onyeisiala emeela ka ọkwa osote onyeisiala bụrụ ihe ụmụaka ji egwuri egwu. Ihe Osinbajo sara? Laolu Akande bụ ọnụ na-ekwuru Osinbajo kwuru na ihe niile ndị ntaakụkọ na-ede gbasara Osinbajọ abụghị eziokwu. Akande kọwara na ọbụghị ihe ọhụrụ na osote onyeisiala ga-anata onyeisiala ikike tupu o mee ụfọdụ ihe. Mana ọdịghị ka ihe ndị a niile a na-emetụ Osinbajọ n'ahụ. N'otu ọgbakọ ọ gara, o ji ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ede maka ya wee kpaa ndị mmadụ ọchị. Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ị na-ekwenye n'ihe ọbụla ha gụtara na sohal midia. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Di m sị anyị lawa na ọ na-abịa - Nwaanyị si South Africa lọta" egwuregwu-49389384,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49389384,Chelsea vs Leicester: Lampard ahụbeghịkwa ụkwụ ya,"Olileanya ndị otu egwu Chelsea inweta mmeri nke mbụ ha n'asọmpi ""English Premier League"" nke afọ 2019/2020 akụọla afọ n'ala ọzọ.","Wilfried Ndidi gburu ndí otu ya ma zọkwaa ha Nke a mere dịka ha na ndị otu Leicester City nyere onwe ha otu ọkpụ goolụ otu ọkpụ goolu n'ụbọchị Sọnde. Frank Lampard ka na-atụkwa anya mgbe ọ ga-enweta mmeri mbụ ya dịka onye nkuzi bọọlụ ndị Chelsea. Mana ndị ma nke a na-akọ n'eguregwu bọọlụ na-ekwu na chi ka bụ ụtụtụ. Ndị nkwado Chelsea sịrị Lampard nnọọ n'ụzọ pụrụ iche. Nwaafọ Igbo bụ Wilfried Ndidi bụ ya gburu ndị Leicester ma zọọkwa ha. Ọ bụ Ndịdị nyụrụ ihe na-esi mgbe Mason Mount nachaara ya bọọlụ were nye goolu mbụ ya na nkeji asaa. Ị ga-eji Wilfred Ndidi tụnyere Ngolo Kante? Mana nke ahụ emeghi ka obi daa Ndidi mba. Nwa amadị a gbalịrị ma saa goolu ahụ na nkeji iri isii na asaa. Otu abụọ a gbalịrị ike ha ịma onye ga-eturu ugo na asọmpị nke taa mana mbọ ha nịịle dị ka mmiri a na-agba n'okpokoro azụ mbe. Otu ihe si gbata kwụrụ ugbua, Liverpool bụ ndị mbụ na tebulu EPL, ebe Arsenal na esote ha. Ha abụọ enwetala akara isii akara isii dịka ha meriri asọmpi abụọ ha. Manchester City na Tottenham nwere akara anọ anọ, ebe Chelsea nwere naanị otu. Manchester United ga-ezute ndị Wolverhampton Wanderers na mgbede Mọnde. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44973632,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44973632,Dino Melaye na-efu efu kemgbe ụtụtụ Tọọsde,Ndị uweojii n'Abuja ekwuola na ha amaghị maka ntọrị onye sinetọ na-anọchite mpaghara ọdịda anyanwụ Kogi steeti n'ụlọ sineti bụ Dino Melaye.,"Dino Melaye Akụkọ gbara n'ụtụtụ taa bụ Tọọsde bụ na ndị ntọrị tọọrọ Dino n'ụzọ ebe ọ na-aga Kogi steeti maka ikpe a gbara ya ebe ahụ. Akụkọ ahụ nke sinetọ si Bayelsa steeti bụ Ben Murray Bruce dere n'akara twitter ya kwuru na ndị ntọrị ahụ ji egbe tọọrọ Dino n'ụtụtụ taa. O kwuru na ha ji ụgbọala Sienna. End of Twitter post, 1 Onye bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode dekwara na twitter ya ma katọọ ya bụ ntọrị ma rịọ ka ha kpọlọta ụlọ n'udo. Mana ndị uweojii n'Abuja gwara ndị ntaakụkọ Sun n'ekwentị na ha amaghị maka ya bụ ntọrị. Onye nkwuchiteọnụ ha bụ Anjiguri Manzah gwara ha na ha enwetebeghi ozi maka ntọrị ahụ. BBC Igbo gbara mbọ inweta ya n'ekwentị mana ọ zaghị. Mana kemgbe ụtụtụ ahụ a tọrọ ya, o nwebeghị onye kwuru okwu banyere ya gụnyere ndị pati ya PDP. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50703742,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50703742,Aisha Buhari: Ihe ise o boro Garba Shehu,"Akwụkwọ ozi Aisha Buhari degara Shehu Garba, onye ozi onyeisiala Muhammadu Buhari, amụnyela ọkụ na soshal midia.","O depụtara na Shehu na-emebiga oke ya dịka onye ozi onyeisiala Buhari. End of Twitter post, 1 Lekwa ihe ndị ọzọ o boro ya Na nchịkọta, nwunye onyeisiala Naịjirịa kwuru na Shehu kwesịrị ịghọta na agaghị anabatazị agwa ya ndị a ọzọ. Mgbe BBC kpọrọ Garba Shehu n'ekwenti, o kwuru na onweghị okwu. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @ESAM_XCLUSIVE na-ekwu ka ha kpezie n'ime ọgbakọ nzuzo ha. @MrOdanz kwuru na ụmụ Naịjirịa ekwela ka okwu dị n'etiti ndị be onyeisiala wepụ uche ha n'okwu e ji n'aka. @Morris_Monye kwuru ka Aisha Buhari jide obi ya aka. Akụkụ ndị ga-amasị gị Igbo People: 'Ndị Igbo, ndị Bini na ndị Yoroba si otu ebe pụta'" afirika-49336152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49336152,Joe Igbokwe: 'Ikpocha ọwa mmiri bụ ezigbo ọrụ',Joe Igbokwe asaala ndị ji ya eme akaja maka ọkwa ọrụ enyere ya na gọọmentị Legọs steeti.,"Joe Igbokwe: Ịkpocha ọwa mmiri masịrị m Mgbe BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti, o kwuru na ọrụ ahụ bụ nke masịrị ya ime n'agbanyeghi ihe ọbụla. ""Ebe ọ na-akwụrụ m ụgwọ akwụkwọ ụmụaka ma kwụọrọ m ụgwọ ụlọ, obi dị m ụtọ"" ka o kwuru. O kwukwara na steeti ndị ọzọ kwesiri ịṅomi gọọmentị Legọs n'iwe ndị abụghị ndị obodo ahụ n'ọrụ. Mana ka ndị mmadụ ji ya eme akaja ka ndị ọzọ na-ewe iwe ihe o ji rite ya bụ ọkwa na mbụ. Otu onye n'ime ha bụ Babatunde Gbadamosi zọrọ ọkwa gọvanọ Legọs steeti. Nhọpụta ndị nwere ọkwa Kọmishona na Legọs Aha ndị kọmịshọna ga-eso aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu arụrụ ọrụ dịka a mapụtara ngalaba ha ga-achịkọta mana nwa afọ Igbo bụ Joe Igbokwe e kwuru ga-e sonyere adịghị ya. Cheta na izu gara aga, aha Joe Igbokwe wuru ewu na soshal midia dịka a ha ya pụtara n'aha ndị Sanwolu zigaara ụlọomeiwu nke Legọs steeti dịka ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka ndị kọmishọna. Na Igbokwe esonyeghị dịka a tụrụanya pụtara ihe ka e duru ndị bụ Kọmịshọna a iyiọrụcụbọchị Tuzde na Legọs. Kama Igbokwe nwetara ọkwa onye ndụmọdụ n'ihe gbasara ọwa mmiri na mmiri. Ndị e duru iyi ọrụ dịka kọmịshọna na steeti ahụ na ngalaba ha na-achịkọta bụ: A hopụtaburu Joe Igbokwe dịka onye ga-esonye na ndị kọmịshọna Legọs steeti Aha Igbokwe sobu na mmadụ iri na asatọ gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwole zigara ụlọomeiwu steeti ahụ ụbọchị Tuzde dịka ndị ọ họpụtara dịka ndị imeobi ya mana o doghị anya ngalaba gọọmentị ọ ga-elekọta. Nke a bụ nke abụọ onye Igbo na-arụ dịka kọmịshọna na Legos. Ben Akabueze rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna 'Economic Planning and Budget' agba abụọ bido n'afọ 2007 n'oge ọchịchị Babatunde Fashola dịka gọvanọ Legọs. Cheta na ụbọchị Tuzde, aha Joe Igbokwe bidoro na-ewu na soshal midia maka ikwu na Channels TV na onye kwuru na Buhari anaghị arụ ọrụ bụ onye asị si ọkụ ala mmụọ. Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu Tupu a họpụta ya dịka kọmịshọna, Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs. Nwa afọ Nnewi, Anambara steeti jikwa ọkwa dịka onyeisi 'Wharf Landing Fees Collecting Authority'. Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe Ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ ahụ dịka Osote odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Sanwo bụ Gboyega Akosile si depụta bụ: 1. Oladele Ajayi 2. Oluwatoyin Fayinka 3. Yetunde Arobieke 4. Olanrewaju Sanusi 5. Bonu Solomon Saanu 6. Kabiru Ahmed 7. Lola Akande 8. Anofi Olanrewaju Elegushi 9. Solape Hammond 10. Moruf Akinderu Fatai 11. Shulamite Olufunke Adebolu 12. Tokunbo Wahab" afirika-43544399,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43544399,Akụkọ kachasi taa: Onye bidoro MMM anwụọla,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Gọvanọ Anambra steeti họpụtara ndị kọmishiọna ọhụrụ.,"Obiano meriri na ntuliaka e mere n'afọ 2017 nke mere ya ugboro abụọ ọ na-achị Anambara steeti Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano, edoola ndị kọmishịọna ọhụrụ iyi ọrụ. Obiano họpụtara kọmishiọna 19 na ndị ndụmọdụ pụrụiche 11, bụ ndị ga-eso ya rụọ ọrụ agba nke abụọ. O kwuru na obi kara ya na ndị a ṅụrụ iyi ọrụ ga-arụ ọrụ ha etu o kwesịrị, ma dọọ aka na ntị na ọ ga-achụpụ onye ọbụla na-arụghị ọrụ ha ọfụma n'ime ụbọchị 100. PDP rịọrọ mgbaghara Uche Secondus rigoro n'ọkwa onyeisioche ndị PDP n'ọnwa Disemba 2017 Otu party PDP arịọọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka mmehie ha mehiere oge ha nọ n'ọchịchị. Onye isioche ha bụ Uche Secondus rịọrọ arịrịo a ka ha nwere ọgbakọ n'Abuja taa. Na mba ofesi Sergei Mavrodi bụ onye bidoro ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM), anwụọla. Sergei Mavrodi ruru afọ 62 tupu ọ nwụọ Mavrodi dị afọ iri isii na abụọ, nwụrụ taa n'ụlọọgwụ dị n'obodo Moscow, ka ndị dọkịta kwuru na nkụchi obi nke bekee kpọrọ (heart attack) gburu ya. Tupu ọ nwụọ, Mavrodi bụ onye mba Rọshịa a ma-ama n'ihe gbasara ịghọgbu ndị mmadụ ma nara ha ego ha, nke ndị bekee kpọrọ ponzi scheme, kpara ọtụtụ ego. N'egwuregwu Ndị ụlọakwụkwọ gọọmentị kolleji Owerri emeriela n'asọmpi cricket nke mbụ a na-eme na mpaghara ọwụwa-anyanwụ maka ụmụakwụkwọ secondary. Nke a bụ mbụ a ga-eme asọmpi cricket nke ndị sekọndarị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Government College na Regal secondary school, nke dị na Nri, Anambra steeti, sọrọ mpi nke ngwụcha iji rite iko nke Omezua Okoro Ezi Okoro. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ndị Igbo na-ekwu mkpa ha gbasara ọchịchị ala Naịjirịa Ị ga-emenwu ka anụmanụ? Lekwa nwaamadi na-eje mkpọtụ ụmụanụmanụ ọfụma." afirika-50328710,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50328710,Igbo Tradition: Kedu ndị na-ehibe iwu n'ala Igbo mgbe gboo?,Obodo ọbụla dị n'ala Igbo anaghị anabata agwa ọjụọ n'ụzọ ọbụla.,"Kama etu ọbụla ọ siri dị, enwere ndị isiike na-agba mbọ ihu na ha mere ihe ndị obodo sị ha ghara ime. Mgbe mmadụ dara iwu obodo n'ala Igbo, Kedu ndị ọ diiri ita ya ahụhụ ma ọ bụ ihu na iwu obodo mezuru? Otu ihe ekwesiri ịghọta bụ na ndị Igbo kwenyere n'otu dị iche iche nke na-enyere aka n'ihibe iwu obodo. Kedu ebe Igbo si? Anyị jụrụ ndị nwere agba n'ihe gbasatara ọmụmụ na Omenala ndị Igbo maka isiokwu a. Ọkammụta Chigozie Nnabuihe na Gladys Udechukwu gwara anyị etu ndị Igbo si echekwa iwu obodo mgbe gboo. Ndị nchekwa iwu n'ala Igbo dịka omenala igbo siri dị gunyere: 1: Nne na Nna Igbo sị na a na-esiri n'ụlọ mara mma pụọ iro. Nwata gara n'ite nne ya zuru anụ, kedu onye ga-ata ya ahụhụ? Oshi bụ otu ihe ndị Igbo kacha kpọọ asị nke mere na Nne na Nna na-ebido mgbe nwantakiri pere mpe akuziri ya gbanarụ nke a. Obodo niile n'ala Igbo nwere iwu megidere izu oshi. Ọ bụ ọrụ ezinụlo ikuziri ụmụ ntakịrị maka iwu obodo ma taa ha ahụhụ mgbe ha daaraiwu ndị a. Ndị Ụmụnna Ndị ụmunna na-abata n'okwu ma ọ karịa ezinụlọ Mgbe nwata mere ihe megide nne ya, ụmunna ga-ejide ya ma taa ya ahụhụ. Nke a bụ maka na ọ bụ ụmụnna ka ọ dịịri ihu na Nwunye ha lụtara ga-enweta nsọpụrụ ruru ya. Nke a pụtara na mgbe ọbụla nwatakiri mejọrọ nne ya, ọ bụ ndị ụmunna ka ọ dịri ihu na orubere nne ya isi. Ndị Ikwunne Ndị Kwunne na-abata n'okwu mgbe nwanwa ha na enye ọgọ ha nsogbu. N'aka nke ọzọ, ijị maa atụ, mgbe nwata kparịrị nna ya, ọ bụ ndị ikwunne ya ka ọ dịiri ita ha ahụhụ. Nke a bụ maka na ha ga-ajụ sị ""Kedu etu nwa nwanne ha nwaanyị mụtara ga-esi kparịa ọgọ ha nwoke"". Ọ bụ ihe a ka ha ga-ebu n'ụche were ga jide nwantakịrị ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme. Ụmụada Ụmụada bara ezigbo ụrụ n'omenala Igbo Ụmụada bụ nzụkọ ụmunwaanyị amụrụ obodo. Mgbe nwanyị alụtara alụta na-akpa agwa na ezighị ezi, ụmụada ga-abịa tinye ọnụ n'okwu ya. Ọkachasị ihe gbasara ezi nna ha ka ụmụada na-abata mezie ihe. I ji maaatụ bụ mgbe nwaanyị na-emegbu di ya maọbụ nne maọbụ nna di ya, ọ bụru kwa na ọna-akparị dị ya, ụmụada ga-abata n'okwu. Dịka Gladys Udechukwu sịkwa kọwaa, ihe ọzọ bụ kwa na ụmụada nwere ike ibanye n'ikpe gbasara nwoke na ndị ụmụnna. Ibi nwaanyị ugwu abụghị ezigbo omenala Inyomdi Umụada na- agbalị ihu na ezinụlo nna ha nwere udo Nke a bụ otu ụmụnwaanyị a na-alụ n'obodo ọbụla. Ha na-etinye karị aka n'okwu gbasatara ụmunwaanyị ibe ha alụrụ n'obodo. Kama ọbụghị obodo niile nwere otu ụmu nwaanyị a. Otu Ọgbọ Ndị otu ọgbọ na-agba mbo ihu na ndi otu ha na-erube iwu obodo isi Mgbe nwata toruru ihe dịka afọ iri maọbụ iri na abụọ, ototuola ibanye otu ọgbọ dị iche iche. Ọ bụ otu ndị a ka ọ dịrị ihu na ndị otu ha na-eme etu iwu obodo siri di. I ji maaatụ bụ mgbe nwoke tiri nne ya ma ọ bụ nwunye ya ihe, ọ bụ ndị otu ọgbọ ya ga-ahụ na iwu obodo mezuru maka agwa ahụ. Otu mmọnwụ, Ekpe na Ọkọnkọ Mmọnwụ na-ekpe ikpe niile. Mgbe mmadụ leliliri nne na nna ya, lelie ndị ọha ndi ọzọ anya, mgbe ahụ ka ndị otu mmanwụ ga-abata n'okwu. Ndị otu mmọnwụ bụ ndị nọchitere ndị mụọ na ndị nnanna nwụrụla anwụ. kama ọ bụghị oge niile ihe mere ka a na-eti mmọnwụ. Mgbe mmadụ mere ihe na ezighị ezi, ma hapụ ime ihe ndị ụmunna, ụmuada maọbụ ihe ndị otu ọgbọ ya si ya mee, mgbe ahụ ka a ga-etipụtara ya mmọnwụ. Ndị otu mmọnwụ nwere ike ita onye ọbụla ahụhu maka ihe ọ mere. Igbu mbembe Ufodu mgbe, mgbe ndị mmọnwụ batara n'okwu gbasara ohi. A ga-ekpe onye ahụ ikpe i mara ma ọ bụ eziokwu ihe ha boro ya. O buru eziokwu a ga-ata ya ahụhụ ma tinye ya ihere n'ihu. Ụfọdụ obodo n'ala Igbo ga-agba ya ọtọ. Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo Kee ya ọmụ ma were ihe ahụ o zuru kee ya n'olu, kpọharịa ya obodo niile gburugburu. Nke a bụ ka emenye ya ihere ma kwusi ya izu ohi. Cheta kwa ilu ndị igbo sị na ""Mmebọ emebọrọ ọgaranya karịri ogbugbu egburu ya"". Otu ihe doro anya bụ na onye ọbụla nwere mgbe ọkwesiri ibata na mgbe ọ na ekwesighi ibata." afirika-49382303,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49382303,Maduka Okoye emela ka agbọghọ Naịjirịa na-eti mkpụ na Twitter,"Kamgbe Vincent Enyeama wụsachara ọwa dịka ochee bọọlụ ndị otu egwu Super Eagles nke Naijiria, ịnwete ochee bọọlụ ọzọ ga-adị ka ya ahịaala nnukwu ahụ.","Nke ka njọ mere mgbe Carl Ikeme, onye nọchiri Enyeama dara n'ọrịa Leukemia. Kamgbe ahụ ndị dịka Daniel Akpeyi, Ikechukwu Ezenwa, nakwa Francis Uzoho anwaala oke ha, mana o doro anya na e nwere ihe dị iche n'etiti 'capital B' na ọkpa ehi. Mana anya nile nọzị n'ebe Maduka Okoye nọ, ka a mara ma ọbụ ya bụ onye nzọpụta a na-ele anya ya. Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst ka otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ ""Nigeria Football Federation (NFF)"" dere aha ndị ha kpọrọ oku n'akara Twitter ha. Maazi Okoye nwere ezigbote aṅụrị na aha ya so, makana ọ sị na oteela ya chọrọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ. Ka nke a mechara, ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ụmụnwaanyị: Ma ndị na-asị na ọ maka, Na-eti mkpu na ọ mara mma nwoke, Etikwa ezigbote mkpu! Hmmm.. Nsogbu were dị nụ... Nke mere otu onye jiri si na ihe ga-eme bụ na ụmụagbọghọ ga na ekiri asọmpị ndị Super Eagles. Onye bụ Maduka Okoye? Nwata nwoke a gbara afọ iri na itoolu bụ na mba Jamani ka ọ na-agba bọọlụ. Aha otu egwu bọọlụ ya bụ Fortuna Dusseldorf II. Nna ya bụ onye Naịjirịa mana nne ya bụ onye Jamani. Ọ sị na Naịjirịa na-amasị ya. N'ọnwa Mee nke afọ o dere na akara Twitter ya na ya na-ele anya ịgbara Naịjirịa bọọlụ mgbe ha zutere Sudan. Carl Ikeme, onye nọchiri anya Enyeama mechara nwee orịa Lukemia Etu e si nabata Maazị Okoye yiri etu e si nabata Carl Ikeme mgbe akpọrọ ya na oru ndị Super Eagles. Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu" afirika-57140201,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57140201,"Ubakala Police Attack: Ndị ekperima awakpola ụlọọrụ ndị uweojii n'Ubakala, Abia State","Ndị ekperima bucha egbe awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Apumiri Ubakala, n'okpuru ọchịchị Umuahia South, isi obodo Abia Steeti.","Ihe ruru ụgbọala iri na ise ka ndị ekperima gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii n'Apumiri Ubakala Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ chọpụtara na ndị ekperima ahụ mụnyere ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọk, ọ gbaa jaa jaa. Ọ hụkwara ihe ruru ụgbọala iri na ise nke a gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii ahụ. BBC nụkwara na mmadụ abụọ nwụrụ na mwakpo ahụ, mana onye ntaakụkọ anyị ejighi anya ya abụọ hụ ozu ha. Ndị mmadụ kwuru na e bupụla ozu ndị ahụ tupu onye ntaakụkọ anyị erute ebe ahụ. Ndị uweojii ekweghị ka onye ntaakụkọ anyị banye n'ogige ahụ, mana ọ nọrọ ote aka seta foto ihe ndị nke anya ya nwere ike ịhụ. Otu onye uweojii na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara ndị nọ ebe ahụ na ya bụ mwakpo malitere n'elekere abụọ na ọkara nke isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a. ""Ndị mere ihe a bụ ụmụ okorobịa karịrị 20 n'ọnụọgụgụ bucha nnukwu egbe,"" onye uweojii ahụ kwuru. Otu onye bi n'okirikiri ahụ kwuru na ha nụrụ ụda egbe ụdị nke mmadụ anụtụbeghị na ntị mbụ. Ụlọ ndị ekperima kuriri n'ogige ndị uweojii n'Ubakala Nwoke a na-achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru sị: ""Anyị chere na agha amalitela na mpaghara anyị."" ""Mgbe ụda egbe bidoro ịka njọ, ebidoro m ịtụ alo ebe m ga-esi gbaa ọsọ ma ọ bụrụ na ihe karịa."" ""Obi mmapụ ekweghị anyị rahụ ụra, onye ọbụla chịcha obi ya n'aka."" Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtakwara na ọtụtụ ụlọahịa dị nso n'okirikiri ebe ya bụ ihe mere emepeghị emepe dịka Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ n'ọnụ Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti, amịtaghị mkpụrụ. Ọ zaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ, ọ saghịkwa ozi anyi zigaara ya n'ekwentị. Arụ gbaa afọ... Ụgbọala ndị uweojii Kamgbe mmalite afọ 2021, mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii nakwa igbu ndị ọrụ nchekwa bụzị ihe na-eme kwadaa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Site n'Abia steetị gaa Enugwu, si Ebonyi gaa Anambra, si Imo banye Delta steeti, ihe na-eme be Oke, na-emekwa be Ọgịnị. Ndị oji egbe na-akpagharị na-agba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, na-egbu ndị uweojii ma na-anapụ ha egbe. Nke a mere ka ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hibe otu nche nke ha kpọrọ 'Ebube Agụ', mana nhibe otu a emebeghị ka nchekwa ka mma." afirika-48237266,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48237266,Original jamb results: Nwafọ Imo dị afọ 15 kachasị mee nke ọma n'ule Jamb,"Ụlọọrụ Jamb ewepụla aha mmadụ atọ kachasị mee nke ọma n'ule eji aba Mahadum nke afọ,","Jamb ụlọọrụ na-ahụ maka uke ejji aba Mahadum na Naịjirịa Ndị a gụnyere Ezenala Ekene Franlin bụ onye Imo Steeti dị afọ iri na ise, o nwere akara dị 347, ọ họrọ Mahadum Legọs dịka nke mbụ ya. Osote ya bụ Igbam Emmanuel Chidiebere bụ onye Abia Steeti dị afọ iri na isii, nwetere akara dị 346 ma họrọ kwa Mahadum Legọs dịka nke mbụ ya. Nke atọ bụ Olowu Isaac Olamilekan bụ onye Osun Steeti, nwetere akara 345, Mahadum ọ họrọ bụ Obafemi Awolowo. Onye na-ahụ maka idebanye aha n'ule a bụ Ishaq Oloyede kwuru na onye nke mbụ na nke abụọ nwereike ha agaghị aba Mahadum n'afọ a n'ihi afọ ole ha gbara. Ule eji aba n'agụmaakwụkwọ mahadum nke afọ 2019 bụ Jamb apụtala taa dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ule a si kwuo. Onye na-ahụ maka idebanye aha n'ule ahụ bụ ọkanmụta Ishaq Oloyede bere akwa dịka ọ na-ewepụta ozi banyere mpụtara ule Jamb 2019 bụ nke elere n'izuụka ole na ole gara aga. O kwuru na isi akwa ya bụ n'ihi oke nrụrụaka jupụtara n'ule nke afọ a n'ọgbọ dị iche iche elere ule a na Naịjirịa. Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Oleyede kwuru na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị 'Force Intelligence Bureau (FIB)' nyere ha aka n'ebe ọ dị ukwuu i nwuchi ndị aka ha dị na nrụrụaka ule a. O kwuru na ha wepụtara mpụtara ule dị otu nde na ọma asaa (1,792,719) ebe ha kpachiri mpụtara ule ruru puku iri atọ na anọ (34,120) bụ ndị a na-enyocha maka nrụrụaka. Ị chọrọ ị mata ihe nwere n'ule Jamb were ekentị gị ziga ozi 'RESULT' n'akara obere a 55019. Sịnetọ Ned Nwoko enwetala asambodo n'aka Inec Ụlọọrụ Inec anapụla Peter Nwaoboshi asambodo Sịnetọ ma nye ya Ned Nwoko dịka onye ga-anọchite anya mpaghara Delta North n'ụlọomeiwu. Nke a na-abịa dịka ụlọikpe nọ n'Abuja na Wednezde chụrụ Peter Nwaoboshi n'ọkwa ahụ n'ihi ihe mgbagwoju anya dị na ntuliaka ime ụlọ PDP mere. N'ofesi Ndị oji egbe awakpoola ụlọ oriri 5 star dị na Balochistan nke mba Pakista bụ ebe ndị mba China hiwere ọtụtụ azụmaahịa. E gbuola otu onye ọrụ nchekwa dịka otu kpọrọ onwe ha Balochisten Liberation Army sị n'aka ha dị na mwakpo a. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Juventus bụ Massimilliano Allegri akatọọla ozi na-efegharị na ọ chọrọ ịhapụ Juventus Allegri kwuru kama na ọ ga-ezute onyeisi otu ahụ bụ Andrea Agnelli n'izuụka na-abịaka na mkparịtaụka. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Nedu Wazobia 1. Kedu ebe Kano kwụ akwụ? Gọvanọ Ganduje gọrọ na ụmụaka soghị binye aka na ndọrọdọrọ ọchịchị emere na Kano Otu ụlọikpe kachasị na Kano steeti agwaala gọọmentị steeti ahụ ha kwụrụ ebe ha nọ n'ịkewapụta ala eze Emir anọ ọzọ n'ime nke dị adị. Cheta na aka na-achị Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje binyere aka n'akwụkwọ iwu ga-ekewapụta ala eze ọhụrụ anọ n'ime nke dị adị nke ndị mmadụ katọrọ. Unu a na-ege ntị? Maka na e meela nwa ada Igbo ọzọ Mayor na okpuruọchịchị Einfield nke dị n'obodo London mba Briten. Kate Anolue bụ onye Nanka ga-eso Cryril Ezeajụghị bụrụ ndị ojii mbụ a ga-eme Mayor na Kasul ha. N'egwuregwu, Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Gernot Rohr bụ aka na-achịkọta otu Super Eagles chị aka n'obi ugbua gbara ahụike Odion Ighalo nke Naịjirịa merụrụ ahụ n'ụbọchị Fraide. Ọ bụ maka na a na-atụ anya na Ighalo ga-eso Naịjirịa mme njem ịbulata iko mba Afrịka n'afọ a. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-43042537,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43042537,Buhari na ndị isi otu APC enwela mkparịta ụka,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari na ndị ndu pati APC gunyere Bisi Akande, Bola Almed Tinubu enwela mkparịta na Aso Rock dị na Abuja.","Nke a bụ nke abụọ Buhari na ndị ndu APC na-enwe mkparịta ụka n'ime afọ 2019 Tupu ha amalite, Buhari na onye bụ buru onyeisiala bụ Abdulsalami Abubakar buru ụzọ nwe mpkarịta ụka ndị were nkeji 25. Abdulsalami ekwughi ihe mere ojiri bịa n'AsoVilla maọbụ ihe isi nzukọ ha bụ. Tinubu bụ onye Gọvanọ Lagos Steeti n'oge gara-aga Na tufughi oge Abdulsalami lara, Akande na Tinubu wuchiri n'obi ọchịchị. Akụkọ kwuru na ihe mere ha jiri bịa bụ maka ọrụ Buhari nyere Tinubu ka o mee udo n'etiti ndị otu pati APC nwere esemokwu. Ebe akụkọ ọzọ kwuru na ọ bụ maka akwụkwọ ozi ndị bụrụ ndị isiala bụ Olusegun Obasanjo na Ibrahim Babangida zigara gwa ka o wepụ anya n'ihe gbasara ọchịchị n'afọ 2019. Onye ọka mmụta bụ Wole Soyinka katọrọ onyeisiala Buhari kwuo na ọ na-arọ nrọ mere na ọ maghị ihe n'eme gburugburu ya. Rue mgbe akụkọ bịara onweghi onye mara ihe ha kparịtara n'ụka. Cheta na ihe bụ nke abụọ ndị a na-enwe mkparịta ụka n'ime afọ a." afirika-50430324,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50430324,HIV Prevalence in Nigeria: Anambara kacha nwee ọrịa HIV n' ala Igbo,Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa ori nchekwa ahụ bụ Human Immunodeficiency Virus ewepụtala etu ihe si gbata kwụrụ gbasara ọrịa ahụ na Naịjirịa.,"Steeti ise akachasị nwee ọrịa HIV na Naịjirịa 'National Agency for the Control of Aids' (NACA) wepụtara nke a n'ọba ozi ha. Dịka nnyocha ahụ si kwuo, ndị nwere HIV na Naịjirịa niile agbadatala otu pasentị na ụma anọ (1.4%). N'afọ gara aga, ha dị otu pasentị na ụma ise (1.5%) Akwa Ibom bụ steeti kacha nwee HIV na Naijiria, ebe Katsina bụ steeti opekarịị mpe. Ndị nwere ọrịa HIV na Akwa-Ibom steeti dị pasentị ise na ụma isii (5.6%), . Ndị na-esote ha bụ Benue steeti (4.9%), ebe Rivas steeti bụ ndị nke atọ (3.8%). Steeti kacha nwee ọrịa HIV na mpaghara ọwụwa anyanwụ Na mpaghara ọwụwa anyanwụ, Anambara steeti kacha nwee ndị nwere ọrịa HIV. Ndị nwere ọrịa ahụ n'Anambara dị pasentị abụọ na ụma anọ (2.4%). Enugwu (2.1%) na Abịa (2.1%) bụ ndị nke abụọ na nke atọ. Mpụtara ule waec agbaala Ngalaba na-ahụ maka ụlọ sekọndrị bụ Waec ewepụtala mpụtara ule ahụ nke ngwụcha afọ. N'ime mmadụ puku itoolu na anọ na ụma (94,8840) lere ule ahụ, mmadụ puku iri anọ na itoolu na ụwa ( 49,679) ndị bụ pasent 52.36 mere ọfụma na sọbjet ise gụnyere maọbụ gụpụ®ụ 'English' maọbụ 'Mathematics.' Naanị pasent 35.10 ndị lere ule ahụ nwetara mpụtara ndị mma na sọbjet ise gụnyere 'English' na ""Mathematics."" Ntuliaka Bayelsa na Kogi David Lyon na Duoye Diri Ugo eberela na mgbagbu na Kogi nakwa Bayelsa Steeti ebe a ga-enwe ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na Satọdee. Ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso zọọ ya bụ ntuliaka. Yahaya Bello na Musa Wada Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ otu APC maọbụ PDP ka ọkwa ahụ ga-agara. BBC Igbo ga na-ewetara gị etu ya bụ ntuliaka si aga n'uju. Ọba nchekwa ahụ nwaanyị A gbapeelaa ọba nchekwa ebe ndị mmadụ nwere ike ịga kirie ma mụtakwa ihe gbasara ahụ nwaanyị na London. Ndị rụrụ ụlọ nkiri a kwuru na ebumnuche ha bụ iji kọwara ndị mmadụ ihe gbasara ahụike ụmụnwaanyị. Dickson Etuhu ọ ga-aga nga? Dickson Etuhu played at the World Cup and the Africa Cup of Nations for Nigeria A ga-aga ụlọikpe mkpegharị n'isi Dickson Etuhu gbabuuru Naịjirịa bọọlụ, bụ onye e jidere ka ọ na-anwa ịzụ maachị. Ma ndị gbara ya akwụkwọ ma ndị ọkaiwu na-anọchite anya ya ekwuola na ha ga-achọ ka e kpegharịa ikpe ya ka a chọtachara ya ihe n'aka. N'ụbọchị 13 nke ọnwa Nọvemba 2019, ụlọikpe mkpegharị dị na Stọkọlm kwuru na o doro anya na Etuhu na otu onye ọzọ na-agbabu bọọlụ nwara ịzụ maachị site n'aka oche goolu otu egwuregwu AIK bụ Kyriakos ""Kenny"" Stamatopoulos, n'afọ 2017. N'aka ọzọ, Marakwa na otu Dream Team bụ ndị na-anọchite anya Naịjirịa n'Olimpiks ga-ezute ma nwee ohere ịzọkasị Saụt Afrịka n'asọmpi abalị Fraịdee. Asọmpi a nke eji etozu maka Olympics 2020 ga ebiri ọkụ n'elekere asaa nke mgbede Fraidee. Ụgbọelu kụrụ afọ n'ala n'Enugwu, Ngalaba ndịagha ụgbọelu Naịjiria ekwuola na ọ bụ eziokwu na otu ụgbọhelịkọpta ha dara kpọkasịa n'Enugwu, kama na enweghi onye merụrụ ahụ. Ha kwuru na ha na-enyocha ihe butere ya bụ ihe mberede. Aisha Buhari na-ewu, Iwe ji ndị mmadụ na soshal midia makana nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari so arịọ ndị Kogi steeti mgbaghara maka gọvanọ ha. Nke a mere ka a kpụrụ ya n'ọnụ kemgbe. N'ofesi, Ndị mba Họng Kọng malitere ngagharịiwe ọnwa ise gara aga Mba Họng Kọng adabanyela riseshọn mere ya nke mbụ n'ime afọ iri, ka ngagharịiwe ha mewere kemgbe ọnwa Juun afọ a ka na-ebiri ọkụ. Akụkọ si mba ahụ apụta kwuru na akụnaụba obodo ha ji ihe ruru pasentị atọ na ọma takpọọ ebe ngwụcha Septemba karịa etu ọ dị n'ọnwa ndị gara aga. Boko Haram eriela mbombo ọsọ ka agha tara isi ndị otu ha 13 Ndịagha Naịjiria egbuola ndị Boko Haram iri na atọ ma merụọ ọtụtụ ahụ mgbe otu abụọ a kwatara ya n'obodo Mallam Fatori dị na Borno steeti. Ka ndị Boko Haram riri mbombo ọsọ, ndịagha tụtara ọtụtụ ngwaagha gụnyere ogbunigwe, egbe ruru iri asatọ nakwa uwe ndị agha. Ntuliaka Kogi steeti, Gọvanọ Nasir El-Rufai nọ na-ebe ndị APC na-eme nkwado maka ntuliaka rịọ ndị Kogi steeti ka ha gbaghara gọvanọ Yahaya Bello n'ụzọ ọbụla o si mejọọ ha. Nke a na-abịa dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ na Kogi steeti na Bayelsa n'ụbọchị satọdee. N'ofesi, A gbachiela ụlọakwụkwọ ahụ na ndị ọzọ dị ya nso Ụmụakwụkwọ abụọ anwụọla ebe mmadụ atọ merụrụ ahụ ka otu nwoke gbawara egbe n'ụlọakwụkwọ dị na Santa Clarita dị na Kalifonia na mba Amerịka. Ndị uweojii na-eche na ọ bụ nwata gbara afọ iri na isii nke ọ bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, kpara arụ a. N'egwuregwu, Federer meriri Djokovic Roger Federer apịapụla Novak Djokovic n'asọmpi tenis bụ ATP nke a na-eme na Lọndọn. Ka ọ dị ugbua, Federer ga-ezute onye meriri n'etiti Rafael Nadal na Stefano Tsitsipas. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala" afirika-44977952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44977952,Dino Melaye: Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ na 'ntọrị' onye omeiwu,"""Dino Melaye bụzị onye a na-achọ achọ!"" ihe a bụ ihe Omeiwu Ben Murray-Bruce dere n'akara ya na Twitter, ma kwuo na ọ bụ nwanne Melaye gwara ya.","Dino Melaye hapụrụ pati APC gafee PDP Ọ kọwara na ndị ji ụgbọala Sienna nọchịrị ihu ụgbọala bu Melaye wee kpụrụ ya gbalaga. End of Twitter post, 1 Melaye kwesịrị ịza oku n'ụlọikpe dị na Kogi. Mana, dịka a ma Melaye ka onye adịghị ata ntị ya ata, o mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ọ bụkwa eziokwu. @Debabz sị na ọ dị ya ka ọ bụ ihe nkiri. @IamNaibi sị na o nwekwara olileanya ikiri ya bụ ihe nkiri ma ọ pụta. @luccavelli kwuru na akụkọ a nwere ka ọ dị. @the_publicman jụrụ etu onye ndị nchekwa ya na ndị uweojii gbara onwe ha egbe ga-esi bụrụ onye ndị ji Sienna ga-anwụchi. @ogundamisi na-ajụ na etu a ọ bụ naanị nwanne Melaye hụru mgbe ""atọọrọ"" ya, ọ ga-enyekwara uweojii aka mee nchọpụta? Mana, enwekwara ndị kwenyere na ọ ga-abụ eziokwu na aka ji Melaye. @Faithwachukwu jụrụ etu onye na-aga ụlọikpe ga-ahazi ntọrị onwe ya. @kem_winnerz_A sị na enwere ike ọ bụrụ eziokwu makana Melaye ""bụ onye a kpụ n'ọnụ site oge mbụ"". Ma ruo ugbua, onwebeghị onye ma nke bụ eziokwu maka ""ntọrị"" a. Ndị uweojii na onwe ha sị ka ndị nwe Melaye bịa gwa ha nke ha ma maka ihe a mere, maka onwebeghị ihe ha nụrụ maka ya. Cheta na Dino Melaye nwere azịza n'ụlọikpe dị na Kogi maka okwu metụtara ibu egbe na aka ndi ntọrị tụrụ ya." afirika-46571464,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46571464,Vice Presidential Debate: Ka o si gaa,"Dị ka a na-akwado ntuliaka onyeisiala Naịjria nke 2019, ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala na-azara ọnụ ha gbasara ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị.","Ndị gụnyere Yemi Osinbajo (APC), Peter Obi (PDP), Umma Getso (YPP), Khadijah Abdullahi-Iya (ANN) na Ganiyu Galadima (ACPN) na-eme nrụrịtaụka a ndị Channels Tv hibere. Osinbajo nke APC kwuru na ọchịchị ha amalitela ịrụ ọtụtụ ihe owuwu nke bụ nke a kacha arụ kemgbe mbido mba Naịjirịa. End of Twitter post, 1 O kwuru na a na-arụ opekatampe, otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ na steeti niile dị na Naịjirịa. Obi nke PDP, kwuru na Naịjirịa so na mba ebe a kacha nwee ndị nọ n'ụbịam nakwa ụmụaka anaghị aga ụlọakwụkwọ, na mbaụwa. O kwukwara etu Naịjirịa si bụrụ onye nke atọ na mba ndị na-eyi ndụ egwu kacha. Obi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị ewepụtaghị ohere ga-eme ka ọrụ gbaa kasa, ma mee ka ọnụọgụgụ ndị ntoroọbịa na-enweghị ọrụ gbadalata karịa ka ọ dị ugbua, na Naịjirịa ga-enwe nsogbu. O tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara ego gọọmentị kwesịrị itinye n'ọrụ ndị na-etolite etolite. Galadima nke ACPN kwuru na site na 2015 ruo ugbua, na ọchịchị adịbeghị mma karịa etu ọ na-adị na mbụ. O kwukwara na enweghị aka ọrụ akala etu ọ ha mbụ, ma kwuo na ọ bụ maka ụkpụrụ ọjọọ gọọmentị tinyere. O kwukwara na gọọmentị na-etinye ego enyemaka Ijeri abụọ kwa ụbọchị n'elu mmanụ a mịpụtara n'ala. Abdullahi-Iya nke ANN, kwuru na e kwesịrị itinye anya n'ihe gbasara ụmụaka na ụmụnwaanyị na Naịjirịa, na ọ bụ ya ga-eme ka ọdiniihu ụmụaka a bụrụ ihe e chekwara echekwa. O kwukwara na mpụ na nrụrụaka juru n'ihe gbasara ụgwọ enyemaka gọọmentị na-akwụ maka mmanụ a mịpụtara n'ala. Getso nke YPP kwuru na ọ gaala ebe ndị ụbịam nọ na Naịjirịa, wee hụ etu ndị mmadụ si ata ahụhụ. O kwuru na pati ya kwenyere na onye Naịjirịa niile nwere ikike. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-53536331,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53536331,Ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ? Lee ihe 8 ị ga-eme.,Ọtụtụ mmadụ na-achọ ka ahụ ha kwụọ mụrụmụrụ makana ọ bụ otu ụzọ esi ama onye mara mma.,"Nke mere na ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịhụ na anụ ahụ ha mara mma n'anya. Nchọcha BBC mere gosiri na mmetọ ikuku Bekee kpọrọ ""pollution"" so n'ihe na-eme ka ahụ mmadụ ghara ịna akwọ mụrụ mụrụ. Ihe ọzọ bụ ajọ ude nakwa ihe otite ndị ọzọ, nri nakwa ahụike onye ahụ. E nwekwara ebumpụtaụwa ihe ndị ọzọ na-esokwa ebute mgbanwe n'ahụ mmadụ dịka nka. Ihu nhịkọ maọbụ akara nka Bekee kpọrọ ""wrinkles"" so na ebumpụtaụwa nke onweghị ihe ihere dị na ya. Mana ọ bụrụ na nsogbu gị bụ ahụ gị ịkwọ mụrụmụrụ, lekwa ihe ndị ị ga-etinye anya na ya. Mgbe BBC kpọtụụrụ ọkammụta gbasara nlekọta akpụkpọ ahụ na UNTH Enugwu bụ Ọkammụta Uche Ojimma ka ọ waa anyị anya maka nke a. Ọ kọwara na akpụkpọ ahụ mmadụ niile abụghị ofu. Ebe ọ dị mfe ịme ka ụfọdụ kwọọ mụrụmụrụ ozigbo, ọ na-ahịa ndị ụfọdụ ahụ. Ebe ụfọdụ sị n'afọ dị mma, ụfọdụ kwesiri ịlekọta anya. O kwuru na ahụike mmadụ na-egosikwa na ahụ ya maka ọbara adịghị n'ahụ, okpo maọbụ ịba nwereike ịme ka anụ ahụ mmadụ dị njọ." afirika-57254785,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57254785,South East News: Ihe mere na o nweghi onye na-akatọ ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ?,Ọ bụzighi akụkọ ọhụrụ maka etu ọghaghara si ada na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe ngwụcha afọ 2020 rute ugbua.,"Ọ na-abụzi chi bọọ a nụ ọzọ dịka ndị oji egbe na-awakpọ ụlọọrụ gọọmentị gụnyere ụlọọrụ ndị uweojii na ụlọọrụ Independent National Electoral Commision (Inec). Nke a ebutela ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ịla ọtụtụ ụlọ na akụnaụba n'iyi ma tinye egwu na ndụ ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Ihe na-atụ anya bụ na kamgbe ihe mkpamkpa ndị a malitere, onweghi ndị maọbụ otu sepụtara isi katọrọla ya. Kama ihe ọtụtụ ndị nkịtị na-eme bụ ị na-ekele ndị oji egbe a maka ""ọrụ ọma"" ha na-arụ n'Ọwụwa Anyanwụ. Cheta na ndị Igbo tụrụ ilu sị ""ọ bụrụ na ihe ọjọọ gbaa afọ, ọ bụrụzie omenala"". Ya mere ọ dị mkpa ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndịisi okpukperechi, ndị eze ọdịnala na ndị nwere agba n'Ọwụwa Anyanwụ pụta ma katọọ mwakpo a na-eme n'obodo. Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu Maka na ọ dị mma ""iwepu aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ"". Ọ bụ eziokwu na o nwebeghi onye maọbụ otu pụtarala kwuo na aka ha dị na mwakpo niile a mana ụfọdụ otu na-achọ nwereonwe site n'aka Naịjirịa. Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu maka mkpa mkpa na-eme n'ala Igbo Okaiwu Goddy Uwazurike na-ekwusike na ihe mere o ji dịka agbara nkịtị maka mkpa mkpa na-akpa n'ala Igbo bụ na ọ bụghị ndị Igbo na-awakpo mpaghara ọwụwa anyanwụ ugbua. O kwukwara n'onyonyo na-efegharịnụ na soshal midia ebe ndị Igbo na-eto ndị oji egbe n'Owerri pụtara na ndị Igbo nabatara onye ọbụla na-akpagbu ndị uweojii na-emegbu ha. Uwazuruike kwuru na ihe ọzọ mere ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo ji gbaa nkịtị maka oke wakpo na-eme na mpaghara ahụ ugbua bụ ụjọ na onyeisiala Naịjirịa nwerike ịnwụchi ha ma ha kwuo maka mkpa mkpa ahụ." afirika-53450800,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53450800,'Aka Governor Okezie Ikpeazu adịghị na nwuchi Emperor Ogbonna',"""Nwuchi ndị uweojii nzuzo nwuchiri Emperor Ogbonna esighi n'aka Gọvanọ Okezie Ikpeazu"".","Emperor Ogbonna anọọla na mkpọrọ ihe karịrị ọnwa atọ n'ihi ihe o dere na Facebook na-akatọ gọọmentị Abia steeti Onye kwuru nke a bụ ọnụ na-ekwuru Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara okwu ahụ. Onye bụ Emperor Ogbonna? Emperor Ogbonna bụ ọkaiwu onye na-akatọ ọchịchị gọvanọ Ikpeazu. N'ọnwa Maachị afọ 2020 ka ndị uweojii nwuchiri ya n'ihi mkpesa Ikpeazu kpesara gbasara ya. Ikpeazu kwuru na Ogbonna kọtọrọ aha ya na soshal midia ma tụgide ya asị. Mana Ogbonna kwuru na ọbụghị ya dere edemede ahụ kọtọrọ aha gọvanọ, kama o kesara ya. Ndị uweojii mechara kpụpụ Ogbonna ụlọikpe ebe ọkaikpe nọ nye iwu ka a kpọchie ya na mkpọrọ. Ogbonna nọ na mkpọrọ tupu ọrịa coronavirus amalite nke mere ka a kpọchie elu na ala. Oge e mechara kpọghee ụlọikpe, ọkaikpe ahụ nyekwara iwu ka a tọhapụ Ogbonna n'ụbọchị 28 nke ọnwa Eprel. Mana ndị uweojii nzuzo bụ DSS gara n'ụlọikpe ahụ ma nwụchikwaa Ogbonna ọzọ, kpọrọ ya laa Abuja. Ebe ahụ ka ọ ka nọ na mkpọrọ ndị DSS ruo taa. Ihe gọọmentị Abia kwuru Ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na aka ha adịghịzi na ihe ọbụla na-eme Ogbonna. Ememanka kọwara sị: ""Ọ bụ eziokwu na gọvanọ wegara mkpesa n'aka ndị uweojii oge Ogbonna dere ihe iji kọtọọ aha ya."" ""Mana okwu ahụ apụọla n'ụlọikpe ebe ọkaikpọ nọkwa nye iwu ka a tọghapụ ya."" ""Ngwa ngwa a tọhapụrụ ya, aka gọọmentị Abia apụọla na ya bụ okwu."" ""Anyị amaghịzi ihe ndị DSS ji buru ya gawa Abuja."" Ememanka gara n'ihu kọwaa na Ogbonna dekwara ihe n'oge gara aga na-akọtọ ọchịchị onyeisiala Mohammadu Buhari. ""O nwere ike ịbụ maka nke a kpatara ndị DSS ji nwuchie ya, amaghị m."" ""Mana aka gọvanọ Okezie Ikpeazu adịghị na ya."" Ihe ndị otu na-anọchite Ogbonna kwuru Otu dị icheiche na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye nke a kpọro 'Civil Society Organisations' nakwa 'Human Rights groups' akpọọla oku ka gọọmentị tọhapụ Ogbonna na-egbughi oge ọbụla. Ha gunyere The Gavel NG, SERAP, 'Connected Development' (CODE) na ndị ọzọ. Ọnụ na-ekwuru ndị 'Gavel' bụ Oluwafemi Ajibade, gwara BBC Igbo na ụlọikpe dị n'Umuahia enyela iwu ka a tọhapụ Ogbonna. Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka DSS kwụọ Ogbonna ego dị otu nde naịra na ụma ise, mana ndị DSS emeghị nke a. O kwuru na ọ bụ ihe jọgburu onwa ya na ngalaba gọọmentị dị iche iche anaghị erubere ụlọikpe isi. Ajibade gara n'ihu kwuo na ezinụlọ Ogbonna ataala nnukwu ahụhụ kamgbe a kpọchiri ya na mkpọrọ. BBC Igbo gbara mbọ inweta otu n'ime ezinụlọ Ogbonna n'ekwentị mana ọ mịtabeghị mkpụrụ ugbua. Anyị ka na-achọ ịnụ ọnụ okwu ha. Mana dịka anyị na-ede akụkọ a, akụkọ ọzọ pụtara na otu ụlọikpe enyela iwu ka a tọhapụ Ogbonna. Ụlọikpe ahụ nyekwara na Ogbonna ga-eweta nde naịra iri abụọ ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ebinyere ya aka n'akwụkwọ. Mana ọkaiwu Ogbonna kwuru na ha ga-etinye akwụkwọ ọzọ ka e belatara ha ihe ụlọikpe chọrọ ka ha mee." 43972739,https://www.bbc.com/igbo/43972739,ILO: Pasent 60 ndị na-arụ ọrụ na-arụ na nke onwe ha,"Nchopụta otu ndịọrụ nke mba ụwa bụ International Labour Organisation na bekee (ILO) n'aha ịchafụ mere, kwuru na ihe karịrị pasenti 60 na ndị na-arụ ọrụ na Naijiria nọrọ onwe ha.","Osote onyeisiala nọnyere ndị ọrụ n'ụbọchị ILO kwuru na ọ bụ ịrụ ọrụ n'ọnọdụ ahaziri ahazi bụ ụzọ kachasị mma. Nchopụta ahụ nke a kpọrọ: ""Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke ndị na-arụrụ onwe ha: ihe ọnụgụgụ ya gosiri"" gosiri ka ọ siri gbasara akụnaụba obodo na ọnọdụ ndị ọrụ nọrọ onwe ha n'ihe karịrị obodo otu narị. E wepụ ọrụugbo, ọkara ndị na-arụ ọrụ bụ ndị nọrọ onwe ha. N'Afrịka, pasent 85.8 ndị na-arụ ọrụ bụ ndị nọrọ onwe ha. N'Asịa, ha dị pasenti 68.6, na mba ndị Arab pasenti 68.6, na Amerịka, pasenti 40, na mba Europe na sentraalụ Asia pasenti 25.1. ILO kwukwara na ndịọrụ na-arụrụ onwe ha na mba na-emepe emepe dị pasenti 93. Ndị ọrụ nọrọ ọnwe ha bụ ụmụnwọke pasenti 63.0 , ebe ndị nwanayị ndị pasentị 58.1. Akụkọ ga-amasị gị:" 43665477,https://www.bbc.com/igbo/43665477,'Aguleri na Igbo Ukwu abụghị mbido Ndigbo' - Eze Nri,Eze na-achị Nri bụ Ichie Emelie Okika adọọla obodo Aguleri na Igboukwu aka na ntị ka ha kwụsị ịzọ onye bụ isi mbido Ndigbo niile.,"Mmanwụ bụ otu njirimara Ndigbo Okika kwuru kusie ike na ọ bụ Nri bụ ebe Ndigbo siri pụta, ma kwukwa n'ihe gbasara isi mmiri Ndigbo bụ okwu mmuọ na e kwesịghị iji mee ihe ndọrọndọro ọchịchị. Ọ bara obodo Aguleri n'Igbo Ukwu mba maka mbọ ha na-agba idegharị akụkọ mbido ala Igbo, ma gwa ha ka ha wepụ aka enwe n'ofe ka iwe ghara iwe ndị chi e nwere. O kwuru sị ""Ọ bụ eziokwu na anyị na ndị Aguleri bụ otu mana ihe dị iche bụ na agụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị be ha. Igboukwu abịadịghị nso n'ihe gbasara akụkọ a"". Okika sị na Eri bụ nna ala Igbo niile si ala Israel mapụta bụ ọkpara nke ise Gad bụ nwa asaa nke Jacob. Nakwa Eri na ndịotu ndịọzọ sị ala Egypt pụta njem tupu ọpụpụ ndị ala Israel n'Egypt. O sị ""Ha mere njem n'elu mmiri ma rue ebe mmiri Omambala na Ezu zuru onwe ha a na-akpọ 'Agbanabo' dị n'obodo Aguleri ebe mmụọ na-edu ha sị ha kwụsị rụọ obodo'. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56034728,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56034728,Real Estate Investment in South-East Nigeria: Etu ị ga-esi zụta ala n'ala Igbo ma rite uru,N'izuụka ole na ole gara aga ka NwadaIgbo Uche Jumbo kwuru okwu sị na itinye ego n'azụmaahịa ala (Real Estate Investment) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa (in South-East Nigeria) na-aghọ ahịa.,"Ọ sị na oke ala atọ ọ zụrụ n'Aba afọ asatọ gara aga, na o ji ego dị nde naịra atọ (N3.8m) na ụme ree ya ugbua mana nke ọ zụrụ na Legọs n'otu oge ahụ na o rere ya nde naịra iri anọ na ise (N45m). Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ ji na-akatọ ya ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Mana BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị na-ere ala nakwa ụlọ na mpaghara Ọwụwanya Anyanwụ ka tinye ọnụ n'okwu a. Kedụ ihe ndị na-ere ala n'Ọwụwa Anyanwụ kwuru? Awka Ọzọ Okwudiri Nwude bụ onye na-ahụ maka ire ala nke bụ in Real Estate Investment nakwa ụlọ n'Awka dị n'Anambra Steetị sị na o nweghi ọghọm dị n'ire nakwa ịzụ ala n'Ọwụwa Anyanwụ. Ọ sị na ịzụ ala dị mma karịa itinye ego n'ụlọakụ maka na ụlọakụ agaghị enye gị ọmụrụ nwa mana ị zụọ ala taa ọ ga-amụtara gị nnukwu nwa echi ma ị chọrọ ire ya. Ọ sị na onye zụrụ ala n'ebe dịka Mgbakwu maọbụ Ebenebe dị n'Awka North n'ọnụego dịka pụkụ naịra 200, na ọ chọrọ ire ya n'afọ atọ na o nwereike ire ya puku naịra 350. Mana ọ bụrụ ebe dịka Awka South zụọla n'ọnụego puku naịra 300 na o nwereike ire ya ihe ruru otu nde (N1m) n'ime afọ abụọ. Nwude sị na ihe mere ala ji adala ọnụ bụ n'ihi mmepe ebe ala ahụ dị, na ọ bụrụ na a malite ịrụ ụlọ maọbụ ụzọ, na ala niile dị na gburugburu ebe ahụ ga-adala ọnụ. N'iji maa atụ, ọ sị na ọ zụrụ ala n'ebe 'Road Safety' dị n'Awka n'ọnụego nde naịra atọ na ụma (3.5m) n'afọ 2016 mana ugbua na ihe a na-ere ala ebe ahụ ugbua bụ nde naịra iri na abụọ (N12m). Nwude sị na etu ka ire na ịzụ ala dị na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ. Enugwu N'otu aka ahụ Chuma Ezealigo na-ahụ maka ịzụ nakwa ire ala n'Enugwu sị na ihe dị mkpa bụ inwete ndị maara anya ala tupu mmadụ azụọ ala. Na onye kwuru na azụmaahịa ire na ịzụ ala adịghị eme nke ọma, nwere na onye ahụ anaghị erute nso maara ihe a na-akọ. Ezealigo sị na ọnụego iji ree maọbụ ịzụ na-ada bụ site na etu mpaghara ala ahụ dị jiri mepee emepe. N'iji maa atụ, ọ sị ndị zụrụ na 'zoo estate' dị n'Enugwu n'afọ ise gara aga zụrụ ya nde naịra iri anọ (N40m) mana ihe a na-ere ya ugbua bụ otu nde narị naịra (100m) ma ọ bụrụ na ị hụ ahụ. Ọ sị na ego ole a zụrụ ala na 'golf estate' n'afọ ise gara aga bụ nde naịra atọ na ụma (N3.5m) mana ugbua ala na-adazi ihe dịka nde naịra iri atọ (N30m). Ọ sị na o nweghi onye zụrụ ala n'Enugwu ugbua na-agaghị ere ya ugboro abụọ karịai ihe ọ zụrụ ya n'afọ ise na-abịa abịa. Ezealigo dọrọ aka na ntị sị na onye chọrọ ịzụ ala ekwesighi ịzụ ala obodo nwe ma ọ bụrụ na ọ gaghị arụ ya ozugbo, na ha nwereike iresi ya onye ọzọ. Ihe mmụta Na nchịkọta, ndị ọkachamara n'ire ala abụọ a mere ka a amata na ego ole a na-ere maọbụ na-azụ ala bụ site n'ebe ala ahụ dị. Na ọ bụrụ ala dị n'ebe mepere emepe, na ọnụego ya ga-adị elu karịa nke dị n'ebe ka na-emepe emepe. Nwude sị na o nweghi iwu na-achịkwa ego ole mmadụ ga-ere ala ọ zụrụ, na ọ bụ ego ole maasịrị onye nwe ala ka ọ na-ere ya. Ihe ọzọ bụ na o nweghi ọghọm dị na mmadụ ịzụ ala maka na ala na-amụta nnukwu ego n'oge na-adịghị anya." afirika-52604605,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52604605,Etu agha na coronavirus si anyụ Cameroon ịkpakwụ,"Beatrice Titanji bụ onye ikike dịrị onye na-amasị ama ama, ji ọṅụ malie elu mgbe otu n'ime otu ndị anaghị ata ntị ha ata kwenyere iwetu egbe ha n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị.","Ha meburu nke a iji nye ndị si na mpaghara ndị na-asụ Bekee ohere ichekwa ndụ ha n'aka coronvirus na-anyụ ụwa ịkpakwụ, mana ọṅụ ya adịla ka akịilu n'ọnụ ya dịka ọgụ na mgba ahụ malitere ọzọ. ""Ọnọdụ a na-atụ ezigbo ụjọ. Puku kwuru puku mmadụ tọrọ n'ime ọhịa"", ka Dkt Titanji gwara BBC. ""Kedụ etu anyị ga-esi gwa ha maka Covid-19?"" Ka o jụrụ. Otu Southern Cameroons Defence Forces (SCDF) ji aka ha kwekọrịta ịtụsa egbe, ka onyeisi ngalaba United Nations bụ António Guterres rịọrọ ka mkpagbu na esemokwu niile na-aga na mbaụwa kwụsị. ""Iwe nje a ji bịa egosila na agha a abaghị uru,"" ka o kwuru dịka ọ sịkwa ""O ruola oge anyị ga-atụsa ngwaagha ma nyụkọọ mamịrị ọnụ ịzọ ndụ anyị."" Tupu ịpụọ n'ezi, gbaa mbọ jide ihe anọ ndị a Mana, enweghi otu ndị na-achọ nnwereonwe ọzọ (ha ruru 15) kwere ege ntị n'arịrịọ a. Otu n'ime otu ndị a a na-akpọ Ambazonia Governing Council, so na ndị nke kachasị ukwu, kwuru sị na ikwekọrịta na ha ga-atụsa ngwaagha ha ga-enye gọọmentị ohere izibata ndị agha ha n'ebe ndị ha zọtarala dịka ebe ha nwere ikike ọchịchị. Agụụ na nrịanrịa Gọọmentị mba Kamerun bụ nke Onyeisiala Paul Biya si na mpaghara na-asụ asụsụ French nọ n'isi ya, ekwebeghi atụsa ngwagha ha ma nọrọkwa n'elu ya machie ụgbọelu ndị chọrọ ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka nakwa ndị nke ndị mmadụ ji eme njem nkịtị, dịka ha sị na ha na-achọ igbochi mfesa ọrịa a. ""Ọ bụrụ na anyị enweghị ụzọ anyị ga-esi wegara ndị mmadụ nri na ọgwụ, ọtụtụ n'ime ha ga-atagbu onwe ha n'ahụhụ. Agụụ na ọrịa ga-egbu ha,"" ka Dkt Titanji bụ onye na-edu otu a kpọrọ Women's Guild for Empowerment and Development, so etinye ọnụ n'ihe gbasara ikpe udo na mba Kamerun. Ma Bekee ma Frenchị bụ asụsụ njirimara mba Kamerun kemgbe ha ji nweta nnwereonwe ha n'aka ndị ọcha, mana ndị nke si na mpaghara na-asụ Frenchị na-achị ka eze, nke mere ka ndị nke na-asụ Bekee na-atamu maka ịkpa oke. Ihe karịrị mmadụ 3,000 anwụọla kemgbe a malite igosi iwe maka etu esi ejikarị asụsụ Frenchị ekwu okwu n'ụlọikpe nakwa n'ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ndị Bekee dị na Nọt-West na Saụt-West bụ nke ọgbaghara chịkọtara ọnụ n'afọ 2017. Ọgbaghara a achụpụla ịhe ruru nde mmadụ - chụba ụfọdụ n'ime ha n'ime ọhịa ebe ha rụrụ ụlọ aja ma bụrụkwa obodo nke ha dịka ha bidokwara ụwa n'isi ka ebe ha si bịa bịazịrị bụrụ ihu agha. Kamerun - ka kewara n'ụzọ ndị ha si n'aka ha nweta nnwereonwe: Ndị ji Afrịka n'agbụ mgbe ochie ""kewarisiri"" okeala Afrịka Ngalaba UN na-ahụ maka ụmụaka bụ Unicef na-ekwu na ọ bụ nanị 255 maọbụ pasentị 34 n'ime ụlọọgwụ 7,421 dị na mpaghara Nọt- West na Saụt West na-arụtụ ọrụ ma ụfọdụ anaghị arụ chaacha maka agha a. ụfọdụ ụlọọgwụ ndị a bụ ndị awakpooro ma gbaa ọkụ nke mere ka ndị na-arụ ebe ahụ gbaa ọsọ. Nke a ebutela ụjọ ihe ga-eme ma ọrịa Covid-19 ruo ebe ndịa ahụ. Dịka ọ dị ugbu a, ihe karịrị mmadụ 2,200 ebutela ọrịa a na Kamerun ebe ihe dịka mmadụ otu narị anwụọla kamgbe ọnwa Maachị, nke mere ka ha bụrụ ndị ọrịa kacha gbuo na mpaghara central Afrịka. Nsogbu a emebiela ọtụtụ ọrụ na ihe ndị mmadụ Enwebeghị ihe gosiri na ndị nnụpụ isi na-alụ ọgụ nwere nchekwa maka coronavirus maọbụ nwee ụlọọgwụ a na-agwọ coronavirus. Dịka ndị gọọmentị mba Kamerun na-alụsọ ndị nnupu isi a ọgụ, Titanji kwuru sị "" Anyị achọghị agha n'oge di otu a n'ihi na ọ mere ka ịnyere ndị mmadụ aka sie ike ọkachasị ugbua coronavirus na-egbu ndị mmadụ""" afirika-50619961,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619961,Sleeping habit: Nrọ ọjọọ a ga-egbochinwu ụjọ ma mmadụ mụrụ anya?,"Ọ bụrụ na ị rọrọ nrọ ọjọọ n'abalị foro taa, o nwere ike ịbụ ezigbo ihe.","Nke a bụ makana ndị nchọpụta ekwuola na nrọ ọjọọ na-eme ka ụjọ belata n'ahụ gị mgbe ị tetara n'ụra. Ndị nchọputa a nọ na mba Swizaland na Amerịka nyochara etu ụbụrụ mmadụ si anabata nrọ dị iche iche. Ha chọpụtara na nrọ ọjọ na-akwalite etu ụbụrụ mmadụ si anabata ihe ụjọ ma onye ahụ mụrụ anya. Mana ha chọpụtara na nrọ na-eyi oke egwu a kpọrọ ""nightmares"" na Bekee, na-emetụta mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma. Dọkita na-ahụ maka ụbụrụ na mahadum nke Geneva, Mahadum nke ụlọọgwụ Geneva dị na Swizaland nakwa mahadum Wisconsin dị n'Amerịka, na-ekwu na e nwereike iji nrọ gwọọ ọrịa nchekasị. Nrọ ga-akwado gị maka ihe ụjọ na-eme n'ụwa Nchọpụta a gụnyere ịma ma nrọ maọbụ oke ajọ nrọ enwere uru ọ baara mmadụ ma ncha. Mpụtara ya, nke e tinyere na ngalaba 'Human Brain Mapping' gosiri na ajọ nrọ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha nabata ihe ụjọ na-eme na ndụ ha. Ka ajọ nrọ na-abawanye, ka ikike ibelata ụjọ na-abawanye n'akụkụ ụbụrụ na-ahazi etu mmadụ si anabata ụjọ. Nke a gosiri na nrọ ọjọọ na-akwado ndị na-arọ ya maka etu esi agbanarị ụjọ ma ha teta n'ụra. Mana nrọ ahụ jiri oke ajọ ụjọ bịa, o nwereike imebi ihe na ndụ mmadụ dịka Lampros Perogamvros onye nchọpụta na mahadum Geneva si kwuputa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: World Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ" afirika-53772873,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53772873,Mkpọnala - Egbe ike na-emete mmụọ na mmadụ n'ụra,"Emume ọdịnala ọbụla e mere n'ala Igbo ma agbaghị mkpọnala, mara na ọ bụ emume ụmụaka.","Mkpọnala bụ ụda e ji akọrọ mmụọ na mmadụ na nnukwu ihe na-eme n'obodo. Akụkụ Igbo ụfọdụ na-akpọ ya mkpọnanị, ndị ọzọ na-akpọ ya ntụnala, ebe ndị ọzọ na-akpọkwa ya egbenduru. Oge ọbụla ya bụ egbe dara, ụmụ nnụnụ eju ọhịa, ụmụ anụmanụ adaa jụụ, obodo niile edere jijiji. Uru mkpọnala bara n'omenala Igbo Akirika Jingo bụ onye e ji ịgba mkpọnala mara n'Ideato, Imo steeti Akịrịka Jingo, bụ onye e ji ịgba mkpọnala mara na mpaghara Ideato North n'Imo steeti, kọwaara BBC Igbo na ịgba mkpọnala bụ ụzọ e ji ekele Chukwu maka ihe mere n'obodo. Jingo kọwakwara na ọ bụghị naanị n'ọnwụ mmadụ maọbụ ihe iru uju ka a na-agba mkpọnala, a na-agba ya ma nnukwu ihe ọbụla mee. Lee uru mkpọnala bara dịka Jingo si kọwaa: Mana Jingo kwukwara na ụfọdụ na-agbakwa mkpọnala iji ya mee ihe ọjọọ. Kama ọ bụghị ha ga-eji aka ha agba ya n'ihi na ha na-asọ nsị egbe e ji agba mkpọnala asọ. Ihe e ji agba mkpọnala Ọ bụ nsị egbe bụ akụrụngwa kacha mkpa e ji agba mkpọnala. Jingo kọwara na ọ bụ kemịkalụ dị icheiche ka a gwakọrọ ọnụ iji rụpụta nsị egbe. Nke ọzọ bụ egbe mkpọnala na onwe ya, nke bụ igwe ndị ọkpụ ụzụ na-akpụ. A ga-ewere nsị egbe sụjuo n'ime igwe ahụ ma were obere aja wụchie elu ya. Jingo kọwara na ọ bụrụ na awụchighi ya aja, ọ gaghị agba. Ọ bụ onye ọbụla nwere ike ịgba mkpọnala? Jingo kọwara na ọ bụ n'aka nna ya ka ya si mụta ịgba mkpọnala. Mana o nweela ndị bịara ka ya mụgosi ha etu e si agba ya. Ọ gara n'ihu dọọ aka na ntị na onye aka ya adịghị ọcha anaghị agba mkpọnala. Jingo kwuru na ""nsị egbe na-akpa nnukwu ike, ọ naghị emere onye ọjọọ ebere."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-48362213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48362213,Embassy Closure: Ihe ọ ga-emebiri ụmụ Naịjirịa,Akụkọ ụlọọrụ gọọmenti etiti na-ahụ maka ihe gbasara mba ndị Naịjirịa n'ofesi emechiela isi Obodo Naịjirịa dị na Serbia na Czech.,Akụkọ kwuru na ha na-agba mbọ ị chutu ndị mmadụ n'ọrụ n'isi obodo Naịjirịa dị na Ukraine. Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mmekọ Naịjirịa na mba ofesi kpụrụ n'ala makana obughị ekwenti ya. Anyị ga na-anwa ike anyị ịnweta ọnụ okwu ha. Ihe mmechi ụlọ nnọchita ozi Naịjirịa na mba Czech na Serbia na-egosi 1)Ọ na egosipụta na ochịchị Gorment Naịjirịa a maghị ihe ha na eme 2)Nke a na-ezi kwa na nchekwa obodo anyi bu Naịjirịa dara onyụpa na egosipụta na otu ha si aur oru n'mba ndi ozo 3)ụmụ Naịjirịa nọ na obodo ndịa ga a nara akwukwo ikike njem obodo ọzọ ma ha chọrọ igbanwe akukwo visa ha. 4)Ndị ndu Naịjirịa ebughị ọ di nma ụmụ Naịjirịa n'obi Ihe a turu anya kaarị Gorment Naịjirịa mee 1)Atụrụ anya na Gorment Naịjirịa kwesiri i nweta ndị ọru isi obodo nwere ikike ihu maka ihe gbasatara ụmụ Naịjirịa nọ na Mba ndịa 2)Ụlọ ọrụ a ga enwe ụbọchị ha ji aru ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 43682349,https://www.bbc.com/igbo/43682349,Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 7 ka egbuchara mmadụ 17,Ndị uweojii kwuru na ha nwụchiri mmadụ asaa ha na-enyo so na ndị zuru ohi n'Offa dị na Kwara steeti.,"Ụlọakụ Guaranty Trust so na ndị awakporo n'Offa Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii ndị Kwara steeti bụ Okasanmi Ajayi, gwara BBC na ndị ohi a gburu mmadụ iri na asaa (17) ka ha wakporo ọtụtụ ụlọakụ n'Offa ụbọchị Tọọsde. Ajayi kwuru na ndị a nwụrụ anwụ gụnyere ndị uweojii itoolu na ndị nkịtị asatọ. O kwuru na ọbụghị mmadụ iri atọ (30) nwụrụ dịka ndị ntaakụkọ si kwuo, kama na enwere ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ n'Offa nakwa University of Ilorin Teaching Hospital. Akụkọ ga-amasị gị Gọvanọ Kwara steeti bụ Abdulfatah Ahmed, kwere nkwa inye onye ọbụla ga-agba ama a ga-eji anwụchi ndị kpara mkpamkpa a nde naịra ise Ajayi kwuru ""Anyị anwụchiela mmadụ asaa anyị na-enyo enyo. Anyị enwetala ụgbọala asaa na ụfọdụ ekwentị ndị ohi a ji mee mwakpo a."" Akụkọ kwuru na ndị bịara zuo ohi otu elekere (site n'elekere anọ ruo ebe elekere ise) a ruru mmadụ iri atọ. Tupu ha ebido mwakpo ha, ha bu ụzọ nọchie ụzọ ma wakpoo ụlọakụ na ụlọọrụ ndị uweojii nọ ebe ahụ ebe ha gburu ma otu onye uweojii dị ime. Ihu otụ n'ime ụlọakụ ndị a wakporo Onyeisi ndị uweojii Naijirịa ezigala ndị ọkachamara n'obodo Offa ime nyocha nakwa imepe obodo ahụ ka ndị mmadụ nwee ike laghachị etu ha si ebibu." egwuregwu-49703095,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49703095,Norwich vs Manchester City: Norwich emeela Man City ka ewu akpụkpa ntị,Norwich abụrụla anụ nkanka mpi dịka ha gosipụtara ike ha na asọmpi ha na ndị Manchester City.,"Na agbanyeghi na mmadụ iri ndị otu Norwich merụrụ ahụ, ha jị anya uhieuhie bata asọmpi a. Ọ bụ Kenny McLean kpuhere ite goolu dịka ọ sunyere otu na nkeji nke iri na asatọ. Mgbe ọ dị ka ndi ManCity ahụwala ụzọ , ka Todd Cantwell nyere goolu ọzọ na nkeji iri abụo na asatọ were chetara Man City ndị ha nọ n'ụlo ha. Dịka a na ajụ na Aguero osokwa n'asọmpị a ka o were isi takaa netị ndị Norwich na nkeji iri anọ na ise. Teemu Pukki gbara ndị Norwich ume dịka ọ sunyekwara goolu ọzọ na nkeji iri na ise. Goolu Rodri nyere na nkeji iri asatọ na asatọ dịka ManCity enwere olilwanya mana otu awụghị na ezie. Na ngwucha, mkpọtụ na-ada na Norwich City dika ha jiri ọkpụ goolu atọ asatara abụọ were chulaa ndị Manchester City. Lee ihe ndị ọzọ gbatara na Premier League taa: Liverpool 3 : 1 Newcastle Brighton 1 : 1 Burnley Man Utd 1 : 0 Leicester Sheff Utd 0 : 1 Southampton Tottenham 4 : 0 Crystal Palace Wolves2 : 5 Chelsea Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-45662707,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45662707,Ihe chụrụ Kenneth Okonkwo n'ọsọ ọkwa gọvanọ Enugu steeti,Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama na ihe nkiri Nollywood chọburu ịba na ndọrọndọrọ ọchịchị mana ụkwụ akpọla ya.,"Ihe nkiri 'Living in bondage' bụ ihe akachasị jii maa Kenneth Okonkwo na Nollywood Okonkwo chọburu ịzọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka 2019 n'okpuru pati APC n'Enugwu mana akụkọ pụtara na-ekwu na ọ gbaghị akwụkwọ e ji agba ya bụ ọsọ. Otu onyeisi na pati APC n'Enugwu bụ Ebubeagụ Okafor gwara BBC Igbo n'ezie Okonkwo esoghị na mmadụ isii ga-azọ ya bụ ọkwa ụbọchị Septemba 30. Kanayo O. Kanayo: Ihe m jiri chọọ ịzọ ịga ụlọomeiwu Okafor kpọpụtara aha ndị gbara akwụkwọ ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati APC n'Enugwu bụ ndị a: 1. Ayogu Eze Eze bụ onye Igboese Nọt na Nsukka, ọ zobuola ọkwa gọvanọ n'Enugwu n'afọ 2015 mana Ifeanyi Ugwuanyi meriri ya. Ọ gara ụlọikpe rue na ụlọikpe ukwu Naịjirịa mana Ugwuanyi merikwara ya wee bụrụ gọvanọ na-achị Enugwu ugbua. Eze chọkwara ịpụta zọọ ọzọ ma ọ bụrụ na o nweta akwụkwọ ikike ndị pati ya na ntuliaka imeụlọ ha ga-eme. 2. Ifeanyi Nwoga Nwoga bụ onye Agbani n'okpuru ọchịchị Nkanụ dị na Enugwu Ist. Nwoga bụ onye ọkaikpe so ndịisi ụlọọrụ nwoga and Associates. Ọ bụbu ọkaipke ukwu nke Enugwu steeti tupu ọ tinyebe anya na ndọrọrndọrọ ọchịchị. 3. Akubue Augustine Akubue bụ dibia Bekee ma bụrụ onye Igboetiti na Nsukka. Ọ ruburu ọrụ n'otu mbaụwa United Nations ihe ruru afọ iri na anọ. 4. Benjamine Eche Eche bụ onye Ọgwụ dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ n'Enugwu steeti. 5. Ejike Ugwu Ugwu bụ onye Igboetiti dị na Nsukka. 6. Geroge Ogara Ogara bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa Igboeze Saụt dị na Nsukka, Enugwu steeti. Kedụ ebe Kenneth Okonkwo nọ? Dịka otu onyeisi n'otu pati APC n'Enugwu bụ Ebubeagu Okafor si gwa BBC Igbo, o kwuru na etu ọdị ugbua, Kenneth Okonkwo esoghizi na ndị na-azọ ndọrọndọrọ maka ọkwa gọvanọ n'Enugwu. Okafor kwuru na nke a bụ maka na Okonkwo agalighi akwụkwọ e ji egosi ebumnobi ịzọ ọkwa ahụ n'ihi ego adịghị. N'okwu ya; ""Kenneth Okonkwo na-eme ihe egwuregwu, ọ pụa si na ya chọrọ ịzọ gọvanọ, a kụọrọ ya aka. ""O ruzie mgbe a ga-agba 'form', a chịta 'form' chịgara ya, gwa ya ego ole e ji agba ya, mana ya bụ nwa okorobịa gosiri na akọwasirọrị ya nkeọma. ""Mana oge akwụkwọ pụtara, e wegara ya akwụkwọ ka ọ gbata, mana ya bụ nwokorobịa gosiri na a kọwaghịrị ya ọfụma ihe ịzọ gọvanọ bụ. ""Nke bụ na o gosiri na o jighi ego ịgab 'fọrọm' ahụ. Onye na-ejighi ego, ekwela ebule ọnụ."" Ebubeagu Okafor BBC Igbo kpọrọ Kenneth Okonkwo ka ọ zaghachi okwu a mana o zaghị oku. Mana onye ndụmọdụ ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Emmanuel Anabueze kwuru na Okonkwo bụ n'izu na-abịa ka ọ ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu ihe mere o jiri na-azọghị ọchịchị ahụ ọzọ. Ego ole bụ akwụkwọ fọm ahụ? Dịka otu APC si kwuo na mbụ, ha kwuru na ha wedatara ego ole e ji agba akwụkwọ nkwupụta maka ịzọ ọchịchị maka ntuliaka 2019. Lee ego ole ọ na-ada 1. Ọkwa onyeisiala - Nde naịra iri anọ na ise (N45m) 2. Ọkwa gọvanọ - Nde naịra iri abụọ na puku narị ise (N22.5m) 3. Ụlọomeiwu sintei - Nde naịra asaa (N7m) 4. Ụlọ nnọchiteanya - Nde naịra atọ na puku narị asatọ na ise (N3.85m) 5. Ụlọomeiwu nke steeti - Puku naịra narị asatọ na iri ise (N850,000) Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50103749,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50103749,Nigerian men: Etu e si ama dimkpa Igbo nwere ogologo imi,Ndị Igbo na-ekwu na a hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya.,"Ebe ọhanaeze Igbo na-esi n'ụzọ gụnyere ịba mmọnwụ, ichi echichi, ịlụ nwaanyị wdgz egosipụta onye bụ dimkpa Igbo, akụkọ a na-egosipụta etu ị ga-esi amata dimkpa site n'akparamagwa. Ihe ọzọ ga-eme ka i kwere n'ihe na-egosipụta onye bụ 'ezigbo nwoke Igbo' bụ ihe otiegwu a ma dịka Phyno gụrụ n'egwu ya sị ""Ị narọ afụ dimkpa, ị nụ isi ego"". O gosiri na e nwere ụfọdụ agwa nwoke ga-akpa i jiri ya mara na ọ bụ nwoke 'tozuru etozu' ka gị na ya na-emekọ ihe. Mana a bịa n'ala Igbo, kedụ akparamagwa ndị ị ga-eji sị na onye a bụ ""dimkpa""? Dimkpa Igbo nwere ogologo imi 1) Nganga Ezigbo dimkpa Igbo nwere ogologo imi na-enwe nganga n'ihi na o kwenyere na onwe ya juru ya afọ. N'ihi nganga a, kama ọ ga-adara gị n'ala ịrịọ gị arịrịọ ọkachasị ebe o kwetara na o mejọghị gị, ọ kara ya mma na ọ gbaara ọtọ pụọ ahịa. n'ihi na ọ na-akwụ na nkwenye ya. Kama n'otu aka ahụ, ọ na-ara ahụ ịhụ ebe ọ na-eme ""mere mere n'ihu gwọmpịtị n'azụ"". Ọ ga-agwa gị eziokwu ma kwụrụ n'ihe o kwuru. Ụzọ ọzọ ha na-esi egosiputa nganga a bụ site n'ọnọdụ nwunye na ụmụ ha. Ọ bụrụgodu nwoke na-agaghị akwụkwọ, ọ ga-achọ ịlụta nwunye gụrụ akwụkwọ ma chọkwaa ka ụmụ ya gụọ akwụkwọ makana ọ ga-abụrụ ya ihe o ji anya isi. Ka ọ bụzị etu ha nwereike na-efegharị n'elu ọgbatumtum ma zụọrọ nwunye ha ụgbọala chara chara? 2) Ịgba mbọ: Dimkpa Igbo ma ihe ekwe na-akụ anaghị eche ka ị nyere aka tupu ọ gbawa mbọ. Cosmas Maduka bụ dimkpa eji ịgba mbọ mara Ọ na-ejiri aka ya achụta enyemaka nke ya. Dimkpa Igbo nwere ogologo imi na-ekweta na ebe ndụ dị, olileanya ka dị. Ị ga-ejiri ihe a mere n'ahịa ọchanja ebe ndị ahịa akwụghị n'akụkụ na-eche ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka tupu ha ewulitewe ahịa ahụ gbara ọkụ, mara. Ọzọ bụ etu ha si tụtụrụkwa ndụ ha ebe ọ kwụsịrị mgbe agha Biafra biri n'afọ 1970, gbawakwa mbọ ihazi onwe ha. 3) Ịsọ mmegbu: Dimkpa Igbo nwere ogologo imi anaghị ekwe ekwe, ọkachasị ma ọ bụrụ onye chọrọ imegbu ya. Ọ gaghị achọ ka ị ghọgbuo ya, makana ya na onwe ya ebughi n'obi ịghọgbu gị. Ọ na-achọ ka ị nwee ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ, makana o mezie gị ọfụma, ị ga-emezikwa ya ọfụma. 4) Ịlụzi nwaanyị: Dimkpa Igbo na-alụzi nwaanyị ọfụma etu ịhụnanya ga-esi gụọ gị agụụ. Henry Onyekuru na-agbara Super Eagles nke naịjirịa bọọlụ si n'egwuregwu bọọlụ akpata ego Ọ bụ na ị nụbeghị na ọ bụrụ na ị chọrọ ịma nwoke Igbo ji ego i buru ụzọ lee nwunye ya anya? Nwoke nwere ike ị na-ata ahụhụ, na-eri nri naanị otu ugboro n'otu ụbọchị, mana ọ ga-agba mbọ hụ na nwunye ya riri nri ma yiri ezigbo akwa. Gịnị ka ị che mere e ji akpọ nwaanyị ""oriakụ"" nakwa ""odoziakụ""? Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?" afirika-53826215,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53826215,CAMA Act: Fada Mbaka akatọọla iwu 'CAMA',Fada Ejike Mbaka adọọla gọọmenti aka na ntị ka ha wepụ aka n'okwu gbasara ụlọụka tupu ha anọrọ n'oche ọchịchị ree ure.,"Mbaka kwuburu na Buhari bụ ""onye nzọpụta"" 'CAMA' bụ iwu gbasara etu e si edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations' nke e megharịrị na nsonso ma nye gọọmenti ikike iwepụ onyeisi ụka maọbụ NGO ma ọ bụrụ na e nwee ebubo nrụrụaka. Fada Ejike Mbaka, onye gbarụrụ ihu maka iwu 'CAMA' tata bụ Wenezde n'ọgbakọ 'Adoration' o nwere n'Enugwu gwara gọọmenti ka ha wepụ aka na CAMA ahụ dịka o kwuru na-akwado imegbu ụka. ""Unu bụ gọọmentị gbaso ụka mgba, unu nwere ike ree ure n'oche ọchịchị."" ""Onye ọbụla na-agba ụka mgba na-agba christ mgba."" Ọ gara n'ihu kwụọ sị, ""Obi adịghị m ọcha. Oge adịghị anya, Mụọ Chukwu ga-eme ihe ga-ama obodo Naijiria jijiji."" Mbaka gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o cheta nkwa niile o kwere tupu ọbata n'ọchịchị. Fada kwuru na ọ bụrụ na ndị gọọmenti ewepụghị anya na Ụka, ụfọdụ n'ime ha nwere ike ire ure n'oche ọchịchị. Mbaka kwuru na gọọmenti kwesiri ị na-enye ndị ntorobịa ọrụ, ime ka nrị dị n'obodo nakwa ọtụtụ ihe eji enyere ndụ aka karịa itinye anya na ka ụka chineke sị aga. CAN, Falana ajụla iwu CAMA, ebe Serap sị na ha ga-akpapụ gọọmentị ụlọikpe Sam Ayokunle, David Oyedepo na Femi Falana gbarụrụ ihu maka iwu 'CAMA' Otu jikọrọ ndị okpukpere Kraịst bụ 'Christian Association of Nigeria (CAN) ajụla iwu ọhụrụ e mere maka ihibe otu maọbụ ụlọọrụ na Naijiria a kpọrọ 'Companies and Allied Matters Act' si na ọ bụ ""akaọrụ ekwensu."" N'ozi nke Adebayo Oladeji bụ onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisi CAN bụ Samson Ayokunle wepụtara, CAN sị, ""Ndị ndu otu 'Christian Association of Nigeria' jụrụ kpamkpam iwu 'Companies and Allied Matters Act, 2020' nke onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nsonso a."" Ọjụjụ CAN na-ajụ iwu a na-abịa dịka otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Socio - Economic Rights And Accountability Project (Serap) na-ekwu na ha ga-akpụpụ gọọmenti ụlọikpe maka iwu ahụ ha kpọrọ ""iwu mkpagide"". Iwu ọhụrụ a kpọrọ 'CAMA' n'aha ịchafụ ebutela nnukwu nghọtahie na Naịjirịa. Serap kwuru si, "" Iwu 'Companies & Allied Matters Act (CAMA) 2020' bụ iwu mkpagide kachasị kemgbe Naijiria ji bido."" ""A ga-eji ya gaa n'ihu ịkpagbu ikike dịrị ụmụafọ. Anyị ga-agbagha ya n'ụlọikpe."" Ọtụtụ ndị mmadụ nwere agba gụnyere ndị isi ụka, akatọọla iwu ha sị na ọ bụ iji iko kunye enwe mmiri, n'ihi na gọọmenti nwereike isi n'azụ ụlọ napụ ndị mmadụ ikike dịrị ha. Dịka ọkaiwu a ma ama bụ Femi Falana si kwuo, iwu ahụ a hazigaharịrị nke nyere ngalaba gọọmenti ikike iweghara otu nke onyeisi ya dajọrọ, megidere iwu Naijiria. ""O megidere ikike dịrị mmadụ ịgbakọ dịka o si dị n'akụkụ 40 nke Iwu Naijiria."" Ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu Cheta na onyeisi ụlọụka 'Living Faith Church' bụ David Oyedepo tinyere ọnụ n'okwu a n'ụbọchị ụka gara aga. O kwuru na o nweghi gọọmentị ọbụla pụrụ ịtinye mmadụ ka o lekọta ụlọụka ọbụla si ahazi onwe ha. ""Naịjirịa bụ ebe ndị mmadụ nwere mwereonwe n'ofufe, atụmatụ a bụ ụzọ a chọrọ iji jichi ụlọụka"" ka o kwuru n'ihe onyonyo na-efegharị Gere ya n'uju ebe a: Gịnị dị n'iwu ọhụrụ CAMA na-akpasu ndị isi ụka iwe? Ya bụ iwu gbasara etu esi edebanye aha ụlọọrụ ọbụla na Naịjirịa nke gụnyere ụlọụka dị icheiche nakwa ụlọọrụ na-abụghị nke gọọmentị nke bekee kpọrọ 'Non-Governmental Organisations'. Ọ bụ iwu CAMA ka e ji hibe ngalaba 'Corporate Affairs Commission' nke ọrụ ya bụ idebanye aha ụlọọrụ dị iche iche n'akwụkwọ gọọmentị. Mana ihe na-akpata nghọtahie na ya bụ iwu bụ ebe o kwuru na gọọmentị nwere ike iwepụ onyeisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ọbụla ma tinye onye ọbụla dị ha mma ma ọ bụrụ na e nwee mkpesa na ndịisi ụlọọrụ maọbụ ụlọụka ahụ tinyere aka na nrụrụ aka. Ụfọdụ cheere na akụkụ 839 dị n'ime ya bụ ụzọ gọọmentị si chọọ ịtinye ụkwụ n'ihe na-eme n'ụlọụka. Ndị ọzọ dịka Roland Nzimora chere na ọ bụ ezi ihe ma gọọmentị chọọ ịtịnye otu anya n'ihe na-aga n'ụlọụka Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụfọdụ ihe dị n'iwu 'Social Media Regulation' bụ nke ụmụ Naịjirịa kwuru na ha achọghị, ka ndị omeiwu tinyere n'ime iwuo ọhụrị a. Gịni ka ọ pụtaara ụlọụka dị icheiche? Otu onye ọkaiwu bụ Amarachi Nwankwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na iwu ọhụrụ a dị mma n'ebe ụlọụka nọ. O kwuru na ihe iwu a pụtara bụ na gọọmentị ga na-elebanye anya n'ihe na-aga n'ụlọụka etu ha si elebanye anya n'ụlọọrụ ọbụla dị icheiche. Nwankwo kwuru sị: ""Ụlọụka ọbụla dị na Naịjirịa nọ n'okpuru CAC (Corporate Affairs Commission) nke nọ n'okpuru CAMA, ya mere na iwu ọbula CAMA tinyere ga-emetụta ha"" ""Ọ bụkwa iji chekwaa ndị mmadụ n'ebe ụlọụka adịgboroja nọ, ọ bụghị ịbanye n'ebe ahụ were oche eze ka iwu a bịara ime"". Kedụ ihe ndị ụkọchukwu na-ekwu? Ihe ndị ọzọ dị n'iwu CAMA a emegharịrị ọhụrụ Ihe ọhụrụ dị n'iwu CAMA nke a emegharịrị ọhụrụ buru ibu. Ọtụtụ ndị ọkaiwu kwuru na ya bụ iwu mara mma n'ihi na o mere ka ọ dịwanye mfe mmadụ idebanye aha ụlọọrụ ya. Lee ụfọdụ ihe ndị dị iche na'iwu CAMA nke ochie na nke ọhụrụ. Ị chọọ ịgụ iwu CAMA nke ọhụrụ a n'uju, lee ya ebe a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: Ọrụ ugbo m na-arụ si m n'obi pụta" afirika-50960220,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50960220,Igbo culture: Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?,"N'ala Igbo mgbe gboo, mmọnwụ bụ otu na-ahụ maka ikpezi okwu na ịkpa udo n'obodo.","A na-agba mmọnwụ n'emume pụrụ iche ọkachasị ma e wechaa ihe ubi, akwamozu nnukwu mmadụ maọbụ okenye. A na-ahụta ya dịka mmụọ ndị nna nna nke mere e ji akwanyere mmọnwụ na ndị bara mmọnwụ nnukwu ugwu. Naanị ụmụnwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ. Mana ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị agba ọhụrụ na-ajụ ihe mere e ji enye ụmụnwaanyị oche azụ n'ihe gbasara iti mmọnwụ. End of Twitter post, 1 Dịka ndị omenala doro anya siri kọwa, ịba mmọnwụ bụrụ ụmụnwoke, ihe ịbanye otu ụmụada bụ nye nwaanyị. Otu n'ime ha bụ Ọzọ McGinger Ibeneme sị: ""Mmọnwụ bụ otu nzuzo. Ọ bụ naanị nwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ."" 'N'omenala Igbo, mmọnwu abụghị maka nwaanyị' ""Mmọnwụ abụghị nwaanyị anaghị."" ""Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị"" ""Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị, kama ọ bụ maka ichekwa obodo."" ""Oge gboo, e nwere ọtụtụ otu; otu ụmụnwoke, otu ụmụnwaanyị, otu ntoroọbịa."" ""Ụmụnwoke anaghị azọ ụzọ ịbanye n'otu ụmụnwaanyị."" Nwaanyị nwere ike ịba mmọnwụ Agbanyeghị na mmọnwụ dịrị ụmụnwoke, o nwere ogogo nwaanyị ga-eru, ọ baa mmọnwụ. McGinger gara n'ihu kọwaa, ""Nwaanyị bụ agbara nwaanyị maọbụ oke nwaanyị enye ya ohere ọ baa mmọnwụ."" Ụdị mmọnwụ dị iche iche Akụkọ ndị ga-amasị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ" egwuregwu-49438342,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49438342,Ifeanyi Chiejine: Ihe asaa i kwesiri ịma maka ada Igbo lara mmụọ,"Akụkọ si n'ọnụ otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) pụta, kwuru na Ifeanyichukwu Chiejine nwụrụ ka ọ rịachara obere ọrịa.","Chiejine, onye gbabuuru otu Super Falcons bọọlụ, nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ọ gbachara afọ 36. Chiejine gbara n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị atọ, Olimpiks abụọ ma butekwa Iko Mba Afrịka anọ Ndị NFF ndị depụtara nke a n'elu Twitter, kwupụtara mwute ha iji kwanyere ya ugwu n'ọnwụ. Ihe i kwesịrị ịma maka Ifeanyi: Ihe ndị mmadụ kwuru maka ọnwụ ya: Rachael Ayegba bụ onye otu ya oge ọ na-agba bọolụ, gwara BBC Sport na ""Ọnwụ ya na-ewute anyị nke ukwu. ""O kwutere okwu ọrịa ya ebe ụfọdụ n'ime anyị nọ, mana ọ gwaghị anyị ihe na-arịa ya."" ""Chiejine nwukere ka kpakpando oge ọ na-agba bọọlụ, mana ọ nwụrụ etu ahụ. Anyị kwesịrị ịgba mbọ tinye anya ebe ndị na-agba bọọlụ ugbua na ndị nke gbauru agba, nọ."" Otu ụmụnwaanyị FIFA gosikwara mwute ha. @oluwashina dere maka ihe niile o mere n'ụwa egwuregwu: @mreds kwuru etu ọnwụ ya si gbawaa ya obi Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" egwuregwu-50532729,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50532729,Man City vs Chelsea: Gaurdiola egosila Lampard na ọ bụ egwu bọọlụ kwọchara ya isi,"Mancheter City na Chelsea, otu egwu bọọlụ abụọ bụ oji isi aghọ mgbọ kwatara ya taa na Premia Lig na aka ogbuọja Martin Atkinson bụ ebe Manchester City nọ merie Chelsea ọkpụ abụọ asatara otu.","Lampard na ekele onye bụbu onyenkụzị ya n'egwu bọọlụ bụ Pep Guardiola Taa Frank Lampard na 'ọga' ya bụ Pep Gauardiola siri ọnwụ n'imi taa ebe N'Golo Kante gosiri Manchester City na azụ sungu ka nọkwa n'ụtọ mbụ ya site na-ịnye City goolu mbụ na nkeji 21'. Manchester City gosiputara iwe ha na nkeji 29' mgbe Kevin De Bruyne mere Chelsea taa kpụchie ọnụ site n'ịsa ya bụ goolu. Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Riyad Mahrez were ọkpụ goolu nke abụọ dulaa Chelsea ezumike n'agba nke mbụ site na goolu ahụ ọ nyere na nkeji 37'. Na nkeji 40, Chelsea ji nwa pem gbalahụ penarity dịka Kepa Arrizabalaga tinyere Sergio Aguero ọkpa, mana ogbuọja ahụghị ya. Willian nke Chelsea gbafuru bọọlụ ebe ndị Man City chụpadoro ya ọsọ Chi ndị Chelsea mụ anya. VAR kwuru na goolu nke ikpeazụ Sterling nyere esoghị ya. Nke ahụ ka Man City kaara iji mechie ya bụ egwuregwu. Cheta na agbanyeghị na Man City kpotere nturu ugo ekpote na sizin gara aga, ọ bụghị taa ka Chelsea gbuwere ha ilu. Chelsea emeriela ha ugboro ise na premia Lig. Cheslea emeriela Man City otu ugboro na be ha n'ime ugboro atọ ha sọgoro mpi. Obi wara Kepa Arrizabalaga nke Chelsea mmiri mgbe goolu Sterling gafere ya Agbanyeghị, cheta na Man City gwọrọ ha ka abacha mgbe ha ji ọkpụ isii gbanye ha ihere na sizin nke so nke a. Mana ị ga-asị na ihe a bụ ọbọ ka Man City bọrọ maka ihe Chelsea mere ha na sizin nke 2007/08 bụ ebe ha jikwa ọkpụ isii asataghị ihe nyụọ ha Ịkpakwụ. Ndị otu egwu bọọlụ abụọ a bụcha tachịị nke bụ na Chelsea bụ ihe ji nturu ugo ọkwa abụọ dịka otu kacha emeri asọmpị ha gbara na be ndị ọzọ. Lampard so na ndị nkụzị bọọlụ asaa e meribeghị ugboro isii so onwe ha n'azụ ha gbara bọọlụ na Premia Lig. Akụkọ ga-amasị gị" 43073712,https://www.bbc.com/igbo/43073712,"Falana: Gbasara Shekaụ, ndị agha anyị na-akọ ihe edeghị n'akwụkwọ",Falana bụ onye ọkaiwu ama ama na Naijiria sịrị na okwu ahụ ndị agha kwuru bụ ajambele.,"Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị Ụnyaahụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Brigadier-General SK Usman kwuru n'akwụkwọ ozi o tinyere aka sị na onye ndu ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau, jikere yiri hijab dịka nwaanyị ma gbaa ọsọ. Falana kwuru na ọbụghị ihe kwesịrị iji nti nụ na ndị agha na-ekwu na ha na-achọ Shekaụ maọbụ na ha achọbala inwụchi ya. ""O ruola ugboro iri ndị agha kwuru na ha egbuola ya. Ugbua, ha asị na ha hụrụ ya ebe ojikere ka nwaanyị na-agba ọsọ. ""Mgbe ha hụrụ ya ka o jikere ka nwaanyị na-agba ọsọ, gịnị mere na ha agbagbughị ya?"" O kwuru na ọ ga akara mma na ọ bụrụ na ha chọta ụzọ ịnwuchi ya tupu ha ekwu wa na ha chọrọ ijide ya. Falana kwukwara na ụta adighirị gọọment na ọgbugbu mmadụ nile na-eme na Naijiria n'ihi na n'ụwa niile, onweghị ebe igbu mmadụ adịghị ugbua. ""Ihe dịrị gọọmenti bụ ịkpụpụha ụlọikpe ka ha ga zara ọnụ ha. onye ahụ ọ bụ onye nkịti , onye ndọrọndọrọ ma ọ bụ onye ọchị ehị."" O gara n'ihu kwue na ọ bụ maka na ọnweghị ihe e mere ndị gburu mmadụ oge gara aga ka ndị mmadụ ji aga n'ihu na-egbu ndị ọzọ." 52397554,https://www.bbc.com/igbo/52397554,Covid-19 Update: Ka gọvanọ Umahi si majaa anyị- Ndị ntaakụkọ akpọchịrị n'Ebonyi,BBCIgbo na ndi ntaakụko a aha ha bụ Peter Okutu nke ụlo mgbasaozi Vanguard na Chijioke Agwu nke SUN kpara nkata ka ha kowaa ihe mere.,"Otu onye n'ime ha bụ Peter Okutu kwuru na ọ bu maka akụko o dere etu ndi agha si wakpo obodo Ngbo di n'Ohaukwu nke di n'Ebonyi steeti. O kwuru na ọ bụ mgbe onyeisi okpuruọchichi ahụ kpọro ya na akụkọ o bdere abụghi eziokwu were si ya bia ka ha tulee ya bu akụkọ o dere ka ndị uwe ojii nwụchiri ya. Okutu Kọwakwara na ndi uweojii amaghị ihe mere a ji sị ha nwuchie ya na ọ bu mgbe ha ruru n'ụloọru ndi uweojii ka ha jụwara ya ihe mere. O kwukwara na ihe o dere bụ eziokwu na ọ bụru na o bu asị, na ndi agha ekwesila ịkpọ ya. Onye nke ọzo aha ya bụ Chijioke Agwu onye dere akụko maka etu ọria Lassa fever si anyu ndi Ebonyi steeti ịkpaku sịkwa na Gọvano Dave Umahi kpọrọ ya maka akukọ odere. O kwukwara na ọ bu ngalaba na-ahu maka ọnu ọgụgụ na ihe sitere n'ọnụ onyeisi ụloọgwụ n'Ebonyi steeti kwuru ka ọ dere. Kama Agwu sị na gọvanọ Umahi nyere iwu ka a kpọchie ya kama e mechara hapụ kwa ya ụbọchi ahụ. Cheta na akụkọ pụtara na ndị ntaakụko na Gọvano Dave Umahi nke Ebonyi steeti na-achipu ya dịka akpọchiri ndi nkaakụkọ abụo a maka ebubo ibusa akụkọ ụgha na steeti ahụ. Ihe gọvanọ Umahi kwuru maka ihe a merenụ Kọmịshọna na-ahu maka mgbaa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji ekwuola na onweghi onye ntaakukọ ọbụla gọọmenti machịri ị bata Ebonyi steeti. Orji kwuru na ihe gbasara ịda iwu gọọmenti hiwere maka iyi mkpuchi imi pụta ezi, na ọ bụ uloikpe ga-ekwu ihe ga-abu ntaram ahụhụ dịrị onye ahụ. O kwukwara na o bu iwu goọmenti Ebonyi steeti hiwere maka coronavirus na ụloikpe ka bụ ndi ga-ekwu ntaramahụhu onye ahu ga-erite. BBCIgbo kpọtụrụ onye okaiwu bụ Ikechukwu Nwabufo ka ọ kọwara anyị ma ya bu iwu ịpịa ụtali ma o ziri ezi. Nwabufo sị na nke mbụ bụ na iwu ọbụla nwere ntaramahụhụ onye dara ya bụ iwu ga-erite. O kwukwara na e nwere iwu maka ndopu ọria nke 1923, kama na onyeisiala wepụtara usoro iwu maka ọria coronavirus nke afọ 2020. O kwukwara na ọ bu nke a ka a ga-eso ma sikwa na-enweghi ebe ekwuru na ya bụ iwu na onye nupuru ya isi ga-erite ụtalị. Nwabufo kọwakwara na ọ bụghị Gọvanọ ka o dịrị ikwu ihe a ga-eme onye dara iwu kama na ọ bụ okaikpe ga-ekwu nke a. O kwukwara na dịka onyeisiala ekwughị na a ga-eti mmadụ ọbụla dara iwu a ụtalị, na Gọvanọ ọbụla enweghi ikike karia onyeisiala nke pụtara na iwu onyeisiala kachasị. Lekwa ebe Umahi na-ekwu ya n'ọnụ ebe a: Gọvano Umahi gwara ndị ntaakụkọ n'Ebonyi steeti sị, "" Unu nwere mkpisi odee, e nwere m koboko"". BBCIgbo kpọtụrụ Gọvanọ Dave Umahi na Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti ka ha tinye ọnụ n'okwu a mana ha azaghị ekwe ntị ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị" egwuregwu-44327251,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44327251,Uwe ndị Super Eagles bụzị 'ahịa iwu',Akụkọ na-apụta na London na-egosi na ndị mmadụ kwụru n'ahịrị na London na-eche ka agape ụlọ ahịa ndị Nike makana ọ bụ tata ka ebidoro ire uwe ndị Super Eagles.,"Ihe onyonyo na-egọsị uwe ọhụrụ ndị Sụpa Igụls Cheta na uwe a bụ nke ndi mmadụ kwuru na ha kacha hụ n'anya mgbe ewepụtara foto uwe ndi otu egwuregwu dị icheiche ji a ga iko mba ụwa na Rọshịa. Ndị mmadu na Twitter na-ekwu na ndị mmadụ na-eche ka ụlọ ahịa ndị Nike gbapere tata akwụrula n'ahịrị tupu chi efo. Nke mere ndị ụlọ ọrụ BBC na London jiri nọrụ n'ala ịgba ndi mmadụ ajụjụ ọnụ banyere okwu a. Na Twitter, @A01379 setere ihe ọhụrụ. End of Twitter post, 1 @conroy_bumpus setere foto na-egosi ndị a kwụ n'ahiri. Onye ọrụ BBC Peter Okwoche na onwe ya setere ihe onyonyo gosiri ndị na-ahiri. @ogundamisi kwuru na ọ bụ sọsọ okwu uwe a ka a na-ekwu na ụlọ ọrụ ya. Ihe a niile mere ojighi tụọ n'anya mgbe ndị @DoubleEph edere na Twitter na ya bu uwe agwụla. Ndi niile na-eme ugbua abughị ihe mere na mberede. BBC Igbo jụbụrụ ajujụ maka uwe ndi Super Eagles a na-ahu na Naịjirịa ebe ndị mere ya ebidobeghi ire ya. Lee otu n'ime uwe nke adiboroja ndị mmadụ na intanet. Ụfọdụ ndị ahịa iwu ebidola ire uwe Naịjirịa na-echeghị ka ụlọọrụ Nike webata ya n'ahịa" afirika-43396473,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43396473,Buhari na ndị ndu ụlọomeiwu kparịtara ụka nzuzo n'abalị,"Akụkọ ekwuola na Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na ndị isi ọgbakọ omeiwu ukwu na nke nta nwere mkparịta ụnyaahụ, 15 Maachị 2018 n'ụlọ ọnyeisiala mgbe ojiri obere oge gafee elekere itoolu nke abalị.","Onyeisiala Buhari jụrụ itinyeaka n'akwụkwọ maka ịmeghị usoro ndọrọdọrọ ọchịchị Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukọla Saraki n'akwa ogbo ya bụ Yakubu Dogara du ndị ọzọ mee ya bụ njem. Ha nọrọ ihe ruru otu elekere na ya bụ ọgbakọ nke amatabeghị isi okwu ya. Cheta na nke a na-eme ka Onyeisiala Buharị jụrụ itinye aka n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu degara ya maka imegharị usoro ntuliaka nke bekee kpọrọ ""Electoral Act amendment Bill"". Ndị ọzọ nọ na ya bụ ọgbakọ nzuzo bụ Ahmed Lawan, onye ndụ ndị Sịnetị, Lasun Yusuf, osote onyeisi ụlọomeiwu nke nata, Femi Gbajabiamila, onyeisi ụlọ nzụkọ, na Sola Adeyeye. Saraki na Buhari kwerikọtara n'aka kamgbe abalị abụọ a Buhari juru itinyeaka n'akwụkwọ maka imegharị usoro ndọrọndọrọ ọchịchị Ndị ọzọ bụ Al-Hassan bụ Chif Wip nke ụlọomeiwu n'ọkwa na ogbo osote ya bụ Pally Iriase: Philip Aduda nakwa ndị ọzọ. Akọkọ kwuru na ọ bụ nanị Aduda bụ onye otu PDP so na ọgbakọ ahụ nke osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu esoghị na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50514447,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514447,AFRIMA Awards 2019: Ihe ndị chabara anya na mmemme a,A na-ekwukarị na ngwụcha izuụka ọbụla na-abụ oge eji akpa obi aṅụrị.,"Ọ kpọtụrụ akpọtụ na ngwụcha izuụka a na mba Amerịka, dịka ụgbọ mmemme African Muzik Magazine Awards (AFRIMMA) chịkọtara ọtụtụ ndị ama ama na-eti egwu n'Afrịka. Ndị dịka Fally Ipupa, 2Baba, Zlatan Ibile, Rema na ọtụtụ ndị ọzọ bịara ya bụ emume. Site n'ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ emume, lee ihe ndị chabara anya n'emume Afrimma nke 2019. Etu o si gaa na soshal midia Ka otu na-ehibe mmemme a kwuputachara na @Nikita_Kering bụ oti egwu ama ama na mpaghara ọwụwa anyanwu Afịrịka dị afọ iri na asaa(17), ndị mmadụ bido kwuwe na nke a nwere ajụjụ so ya. Lee ihe otu onye juru. @lexzy4rael gara n'ihu kele nwada a kwuru na ọ dị afọ iri na asaa bụ oti egwu egwu ama ama na mba Kenya nakwa Afịrịka. @obiadohtv kwuru na ihe ngosi Teni na-eti egwu tọrọ ya ụtọ nke ukwu. @ValieDan sepụtara onye Moroko yi uwe Ankara nke Afịrịka wee wụchie na mmemme ahụ. @MicheyMiles na-ekele Awilo Logomba onye nke o kwuru kpara ya obi ụtọ mgbe o na-etolite etolite. @iotama22 sepụtara okwu mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na ngosi omenaala Naịjịrịa bụ Lai Mohammed kwuru na etu ndị mmadụ si na-akwa ya emu. AFRIMMA nke 2019 mere na Dallas, Texas ebe ndị dịka Zlatan bụ otiegwu Naịjirịa ritere nturuugo ọkaibe na ndị malitere tiwe egwu ọhụrụ nakwa maka egwu akpọrọ ""Killin Dem"" nke ya na Burna Boy tiri. Burna Boy bụzị akara ọkụ ugbua na ndị na-eti egwu na Naịjirịa, ritere nturugo ọkaibe n'iti egwu na mba Afrịka. Lekwa ụfọdụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ ritere nturugo na ya bụ mmemme nke 2019 Phyno- Ọkaibe na ịma mbem Burna Boy x Zlatan - Killin Dem- Egwu bụ ọkaibe Rema - Dumebi: Ihe onyonyo kachasị Davido- Ọkaibe maka itiegwu gafere mba ofesi Mercy Chinwo- Ọkaibe n'iti egwu ụka Izzy Odigie- Ọkaibe n'ịgba egwu na mba Afịrịka niile Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro" afirika-47222785,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47222785,Police station Fire: Ndị omekome agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, gwara BBC na ụlọọrụ ndị uweojii ahụ dị n'Ajali, gbara ọkụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Tọọzde.","Akụkọ dị mkpa: O kwukwara na onweghi onye uweojii nwụrụ na ya bụ ọkụ gbara n'okpuruọchịchị Orumba Nọt. Haruna kọwara na ha chere na ọ bụ ndị omekome kpara ya bụ mkpamkpa mana ha na-eme nyocha gbasara ya. Ndị chịbụrụ mbụ dị ka Abdusalami Abubakar, na ndị ụkọchukwu so bịa emume ahụ Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa gụnyere Muhammadu Buhari nke APC na Atiku Abubakar nke PDP, ebinyela aka n'akwụkwọ udo. Ị na-ajụ ihe ọ pụtara? Ọ putara na ha nwere nkwekọrịta na ha agaghị eme ihe ọbụla ga-ebute ọgbaghara n'obodo ma oge ntuliaka ma mgbe e mechara. Nkwado Inec: Ndị ụlọọrụ Inec nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ekewela nkwụcha maka ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị a. Ha na-eme nyocha igwe e ji eme ntuliaka Ka ndị ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọorụ ha n'Abịa nakwa Anambara, ha hụrụ ebe ha na-akwapụta, na-agụkọ ma na-ahazi ngwaọrụ gụnyere igwe kaadị rida, igbe ntuliaka nakwa ihe ndị ọzọ e ji eme ntuliaka. Lee nkwado ha n'uju ebe a: Nkwado ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ ebirila ọkụ N'ofesi, Aka akparala otu nwaamadị maburu ego ndị ụlọakụ gbalaga na mba Frans. Nwaamadị ahụ aha ya bụ Adrien Derbez, zuru nde dọla atọ ka ya na ndị otu ya na-arụ ọrụ dịka ndị na-ekesa ego, gara ikesa nke ụbọchị ahụ n'otu ụlọọrụ Western Union dị n'Aubervilliers. N'egwuregwu, Tottenham enyeghi ndị otu Borussia Dortmund ohere iji ha eme akaja ka ha zutere na Champions League n'abalị. Ha ji goolu atọ si n'ụkwụ Son Heung-Min, Jan Vertonghen, na Fernando Llorente gosi Dortmund na a naghị akparị mmadụ na be ya. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri gbasara Peter Obi ebe a: Ihe ndị ma Peter Obi nwere ikwu maka ya" afirika-44844157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44844157,Ntuliaka 2019: Chris Okotie esonyela n'ọsọ ọkwa oyeisiala,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Gọọmenti etiti ekwuola na mmeri Fayemi meriri n'Ekiti steeti gosiri na ndị mmadụ nabatara ọchịchị onyeisiala Buhari. Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Mịnịsịta okwu mgbasaozi dị n'aka bụlai Mohammed kwukara na mmeri ahụ mechiri ọnụ ndị na-ebu ozi okwu asị. Naịjirịa Ndị chọrọ ịba ọkwa onyeisiala na 2019 na-abawanye ụba. Naijiria ga eme ntuliaka n'afọ 2019 Otu onye ọzọ ekwupụtala ebum n'obi ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. Onye a bụ ụkọchukwu ndị Household of God Church bụ Chris Okotie. Nke a ga-emekwa ya ugbo anọ Okotie ga-azọ ọkwa ebe ọ zoburu n'afọ 2003, 2007 na 2011. Akụkọ mba ofesi Trump enyela Theresa May ndụmọdụ tara akpụ May: Gọọmentị anyi kwesịrị ime otụtụ ihe Aka na-achị mba UK bụ Theresa May ekwuola na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gwara ya ka ọ kpụpụ otu EU ụlọikpe kama ịkparịtaụka maka Brexit. Trump ekwubuola na o nwere ihe ọ gwara nwaanyị May ka ọ mee man May chere na o siri ike. N'egwuregwu, Novak Djokovic alaghachiela n'elu Wimbledon. Nke a bụ nturugo Wimbledon nke anọ Djokovic na-enweta N'egwuregwu Novak Djokovic emeriela Wimbledon nke anọ oge ọ gbapụrụ Kevin Anderson. Djokovic nwetara nturuugo mbụ Grand Slam ya kamgbe ihe karịrị afọ abụọ site na mmeri ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'" afirika-44632972,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44632972,Akụkọ kachasị n'abalị a: Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa,Akụkọ dị mkpa; Emmerson Mnangagwe ekwuola na Grace Mugabe chọrọ igbu ya .,"Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ bụ ndị otu nwunye onyeisi mba n'oge gara aga bụ Grace Mugabe chọrọ ị ji ogbunigwe gbagbuo ya. Cheta na mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri anọ nwere mmerụ ahụ n'ogbunigwe gbara oge ọgbakọ ndọrọ ndọrọ n'ala ahụ. Buhari, Saraki na Dogara emeela mkpebi maka nsogbu dị na Platu Steeti: N'ihi ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ na Platu Steeti, onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka ime ụlọ taa. Na mkparịta ụka ahụ, Buhari gwara ha na o bu n'obi ikpogharị ọrụ nchekwa na Naịjirịa. Ọgbaghara atala isi mmadụ ruru narị atọ n'Ebonyi/Krọss River Steeti: Ndị mmadụ bu akpa ha agbapụ ọzọ agbaga obodo ndị ọzọ Ndị obodo Igbeagụ dị n'Ebonyi Steeti agbala ọsọ ndụ na-eleghi anya n'azụ maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị Ukelle nke Kross Riva Steeti n'ịzọ oke ala. BBC Igbo chọpụtara na esemokwu ahụ bụ nke malitere kamgbe afọ 2015 atala isi mmadụ ruru narị atọ. N'egwurewgu: Mba Jamịnị bụ ndị ji bu Iko Mbaụwa agwakọrọla laa na nke afọ a dịka Saụt Korịa gbara ha ọkpụ abụọ asataghị otu N'aka nke ọzọ sweden gbara Mexico ọkpụ atọ mana mba abụọ ndị etozuola oke n'agba abụọ nke asọmpị a. Nkeji Nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị" afirika-49855498,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49855498,Big Brother Nigeria: Mpi Tacha na Mercy sụrụ mere ka ndị mmadu na-ajụ ajụjụ,Egwuregwu Big Brother Naija abaala n'egwu nchakasị anya ugbua.,"Nke kpụ ọkụ n'ọnụ ugbua bụ esemokwu dị n'etiti Tacha na Mercy. Ihe onyoonyoo gosiri ebe Tacha na Mercy na-aba mba na-akọkwa onwe ha ọnụ. Mercy kwuru na Tacha nwere ahụ na-esi isi ebe Tacha kpọrọ Mercy 'drop out' nke pụtara onye agụchaghị akwụkwọ. Tacha dọkwara Mercy aka na ntutu. Nke a mere ka ndị nkwado ha malite ịkọrịta onwe ha ọnụ na soshal midia. Nwaada akpọrọ Khloe, onye sonyere n'egwuregwu BigBrotherNaija n'afọ gara aga, tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ. Khloe jụrụ Big Brother ihe kpatara o ji chụpụ ya na enyi ya nwoke bụ KBrule n'afọ gara aga. O kwuru na ihe na-eme ugbua n'ime ụlọ BBNaija karịrị ihe e ji chụpụ ya na Brule n'oge ahụ. Onye ọzọkwa tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Uti Nwachukwu. Nwachukwu bụ onye tuuru ugo n'egwuregwu Big Brother Africa n'afọ 2010. Ọ jụrụ ma ọbụzịkwa ihe e kwuru ka a na-eme n'egwuregwu ahụ. Ndị ọzọ tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu: @benjimoola kọwara etu ọgụ ahụ si bido: @Shirleytohcute1 gosiri foto mgbe Mercy gara ife ala nna ya iji gosi na ọbụghị 'drop out' dịka Tacha si kwuo. MannyTeju kwuru na e kwesịrị ịchụpụ Tasha maka ịdọ Mercy aka na ntutu isi. Cheta na n'ụtụtụ Fraịde, a chụpụrụ Cindy na mberede. Ebuka onye nhazi egwuregwu BBNaija batara n'ime ebe a nọ eme egwuregwu ahụ wee sị Cindy ya kwara lii. Egwuregwu BBNaija ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Ọktoba. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnụdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana" 44475271,https://www.bbc.com/igbo/44475271,Ụlọikpe achụdala sinetọ Aidoko,Gabriel Kolawole nke Ụlọikpe ukwu nke ọkaikpe dị n'Abuja achụdara sinetọ na-anọchite Kogi-East (PDP) bụ Atai Aidoko ma nye Isaac Alfa ọkwa ya.,"E wepụtara Atai Aidoko dịka onye nnọchite PDP na ntuliaka imeụlọ PDP mere na ọnwa ikpeazụ nke afọ 2014 Kolawole kwuru na mwepụta ewepụtara Aidoko dịka onye ga-anọchite PDP na ntụliaka imeụlọ PDP mere n'ọnwa ikpeazụ nke afọ 2014 adabaghị ma nye iwu ka Inec nara ya akwụkwọ mmerị ha nyeburu ya. End of Twitter post, 1 Ọkaikpe nyekwara iwu ka e duo Air Marshall Isaac Alfa (rtd.) nke otu PDP n'iyi ọrụ. Ka e wepụtachara Aidoko dịka onye ga-anọchite PDP na ntuliaka imeụlọ PDP, ka Alfa gbara ya akwụkwọ n'ụlọikpe rịọ ka ụlọikpe kagbuo mwepụta ahụ. Ụlọikpe nyere Inec iwu ka ha nye Alfa akwụkwọ mmeri ọhụrụ dịka onye meriri na ntuliaka imeụlọ nke PDP mere n'abalị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2014 Ụlọikpe dakwara Aidoko nha n'otu PDP N750,000. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50514452,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514452,Accident victim help: Etu ị ga-esi nyere mmadụ aka ghara igbu onwe gị,Onye ọkwọ ọgbatumtum anwụọla ebe ọ na-azọpụta nwoke kụrụ ụgbọala ya na poolu ọkụ latrịk.,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Lagos steeti bụ Elkana Bala kwuru na ọkụ latrịk dọgburu onye ọkwọ ọgbatumtum ahụ aha ya bụ Abdullahi Hassan ebe ọ gara ịzọpụta nwoke ahụ nwere ọdachị a. N'okwu Elkana, ""Ọkụ latrịk dọgburu Hassan mgbe ọ zọrọ ụkwụ n'elu eriri ọkụ latrịk ahụ ụgbọala kuturu poolu ya."" Onye na-azọpụta mmadụ na-ebuzo azọpụta onwe ya. Lee ihe ole na ole i kwesiri ịma tupu ịgbara gawa ịzọpụta onye ihe mberede ọbụla dakwasiri dịka onye ọkammụta n'ihe gbasara nchekwa si kwuputa. Akụkọ ndị ga-masị gị" afirika-50387175,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50387175,Chika Ofili: Onye bụ nwata Igbo a ụbụrụ ya na-acha ọkụ?,Chika Ofili bụ nwa afọ Naịjirịa bi na mba UK eritela nturugo 'TruLittle Hero' maka nchọpụta ọhụrụ o mere na mgbakọ na mwepu.,"A bara nchọpụta ya 'The Chika Test' n'ihi na ọ bụ naanị ya mere nchọpụta ahụ kemgbe ụwa. Chika dị afọ iri na abụọ meriri mmadụ anọ, ụfọdụ ndị tọrọ ya nọ n'ogo irite ya bụ nturugo. Dịka ụlọọrụ nturugo ahụ si kwuo, Chika bụ nwata a ma ama na-anọchịte anya ụlọawkụkwọ ya n'asọmpị agụmakwụkwọ dị icheiche. Ihe ịmaghị maka Chika Ofili Chika Ofili bụ nwata dị afọ iri na abụọ na-agụ akwụkwọ na ""Westminster Under School"" nke dị na mba Briten. E ji ịhụnanya o nwere na agụmakwụkwọ, ọ kachasị mgbakọ na mwepu mara ya. Ọ kachasị mee ọfụma n'ule mgbakọ na mwepu ndị karịrị afọ iri na otu mgbe ọ ka dị afọ asaa. Ihe onyonyo ga-amasị gị Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-51848013,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51848013,Odion Ighalo: Onye nzọpụta abịago?,Igbo sị na a nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ mana enwekwara ndị na-anyụ karịa ibe ha.,"Odion Ighalo nyere aka bulite ọnọdụ ndị Manchester United n'asọmpi ha niile na premiership n'asọmpi ndị ọzọ ha gbara. Ọtụtụ anabataghị ọzụzụ ndị Man Utd zụrụ Ighalo kama nkata ekpuola ha n'isi dịka Ighal na-egosi na ọ bụ dike n'ịgba bọọlụ. Lee ihe ndị ikwesiri ị ma mere ka nwoke a ji bụrụ ""a kwaa ọ kwụrụ"" Ihe ị kwesiri ịma maka Odion Ighalo? Ighalo bụ nwaafọ Naijirịa amụrụ n'afọ 1989. A mụrụ Ighalo n'Ajegunle dị na Legọs steeti. Ọ na-agba bọọlụ dịka onyee goolu nke ndị Bekee na-akpọ ""Striker"". Ighalo bidoro ịgba bọọlụ ya na Naijirịa na otu Prime na Julius Berger. Ọ bụ otu Shanghaị Shenhua ka ọ sị bia Manchester United na mgbaziri. Ighalo na-enyere ndị na-enweghị etu ọha ha na Naijirịa aka. Ọ bụ onye mbụ bụ onye Naijirịa gbarala ndị Man Utd ma nyekwara ha goolu. Barcelona chọburu ịzụta ya ma okweghị ịga. Ịbịa Manchester United dịka ịlọta ụlọ n'ihi na ndị ezinaụlọ ya bi n'obodo Manchester. Ọ bụ ya bụkwa ọnye kachasị nye goolu n'asọmpị iko Afrịka nke afọ 2019. Ighalo kwụsịkwara ịgbara ndị Naijirịa bọolụ n'afọ 2019." afirika-43182733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43182733,International Widows Day 2019: Kedụ ihe bụ ebumnuche gị maka ịgba mkpe?,"N'ala Igbo, ịgba mkpe bụ ọmenala nwaanyị di ya nwụrụ anwụ kwesịrị ime iji gosi na ọnwụ di ya wutere ya ọfụma.","Kamgbe ụka batara ala Igbo, ọ bụghịzi ebe niile ka a na-akpụ nwaanyị na-agba mkpe isi Na gboo, ndị Igbo na-ekwu na nwaanyị na-ekweghị agba mkpe di ya ma ihe gburu ya. Mgbe gboo, ụfọdụ na-enye nwaanyị ahụ mmiri eji saa ozu di ya ahụ ka ọ ṅụọ ma ọ bụrụ na a na-enyo ma aka ya ọ dị n'ọnwụ di ya. N'ụfọdụ obodo, ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ kwesịrị iji akwa na mkpu otiti mete ndị na-arahụ ụra n'isi ụtụtụ. Ụfọdụ na-ahapụ nwaanyị ahụ n'ime otu ọnụụlọ ebe adọwara ozu di ya, ka ya na ya nọrọ abalị ole na ole tupu elie ya. Ebe ụfọdụ, anaghị ekwe nwaanyị na-agba mkpe saa ahụ ruo oge a ga-etinye ozu di ya n'ala. Mgbe gboo, a ga-eduru ya gaa n'akụkụ mmiri iyi ebe a ga-asa ya ahụ ma kpụọ ya isi na ntutu niile dị ya n'ahụ. Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye Ụfọdụ anaghị ekwe nwaanyị isi mkpe rie nri ọha niile na-eri maka na ha kwetara n'onwere ike igbu ya, a na-esi nri nwaanyị isi mkpe na-eri iche. Mgbe gbuo, nwaanyị na-agba mkpe di ya bido oge ọ nwụrụ ruo ọnwa isii maọbụ otu afọ, mana ka ụka batachara ala Igbo, ụfọdụ na-agba nkpe nanị afọ atọ. Etu esi ama nwaanyị na-agba mkpe N'agbanyeghị n'ụka batara ala Igbo gbanwee ọtụtụ ihe, ụfọdụ obodo ka na-eme emume ịgba mkpe nke kpatara n'onye ọbụla hụrụ ya ga-ama na ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ. A ka na-agba mkpe n'ala Igbo? A ka na-agba mkpe n'ọtụtụ obodo dị icheiche n'ala Igbo, kama etu esi agba ya bụ mkpe agbanweela. Ọbibịa ụka na agụmakwụkwọ mere ka ntaramahụhụ nwaanyị na-agba mkpe na-ata belata. Ụfọdụ ndị di ha gụrụ akwụkwọ na-enye iwu tupu ha anwụọ, sị onye enyekwala nwunye ha nsogbu maọbụ taa ha ahụhụ. Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile" afirika-57338456,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57338456,"Ebonyi herdmen attack: 'Etu ndị ọchiehi si wakpoo anyị, gbụọ otụtụ n'ime anyị'","Abagu Samuel, otu onye na ndị merụrụ ahụ dịka ndị ọchịehi wakporo maa gbuo ọtụtụ ndị mmadụ akọọwala ihe ha gabigara.","Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi kwuru na gọọmentị ya agaghị agba nkịtị ndị ọchịehi a na-edịna ma ụmụaka dị afọ abụọ, ụmụnwaanyị ndị Ebonyi bi Benue, na-ebusi ndị nwoke. Umahi, onye kwuru n' Abakaliki ụbọchị Tuzde oge ọ gara leta ndị merụrụ ahụ n' ụlọọgwụ 'Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital' Abakaliki sị na ya bụ arụ akarịala. "" Ị hụtụla etu ndị ọchịehi ga-esi na-edina ụmụaka dị naanị afọ abụọ, egbu nne,egbu nna maka ihe mmadụ amaghị?"" Umahi, onye gbara ama na ọtụtụ ndị Izzi bụ ndị e kenyere na Benue steeti, ebiela na Benue steeti ihe karịrị afọ 100 ma na-atụ ụtụ isi ha ebe ahụ nyere Kọmishona steeti ahụ na-ahụ maka ikpe udo ntụziaka ka ha hibe otu Ebubeagu na Benue iji chekwaa ndị Ebonyi bi na Benue steeti. Ọ gara n'ihu rịọrọ gọọmentị Benue arịrịọ ka ọ kpọhachi ha n'Ebonyi ma ọ bụrụ na ha agaghị echekwa ndụ mmadụ n'iile. Ọ gwakwara ndị ọrụ nchekwa ka ha nwuchie onye ọchịehi ọbụla ha hụrụ bue egbe ""AK 47"" na steeti ahụ. Na nsonso a ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịịehi wakporo ndị Izii bi na Benue steeti gbuo ọtutụ ma merụkwa ụfọdụ ahụ. Lee ihe Abagu kọrọ n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu : O nweghịzị ndị Fulani ọchị ehi nọ n'Ebonyi - Ndị Uweojii Ndị uweojii n'Ebonyi steeti n'akọwa na kepu kepu na-efegharị maka egwu mwakpo ndị Fulani na-achị ehi n'Ebonyi steeti niile ugbua bụ egwu nkịtị. Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Ebonyi na-ekwu na ya bụ asịrị abụghị ihe ọhụrụ na steeti ahụ. Ọ sịkwa na ọbụghị naanị otu ebe ka ọ na-eme n'Ebonyi agbanyeghị ihe niile ndị uweojii na-agwa ndị mmadụ maka ị kwụsị ya. Odeh sị na izu atọ gara aga, ọ bụ n'Ezzangbo na Onuebonyi, ụbọchị ole maọbụ ole gara aga ọ bụ n'Amike Aba. O kwuru na ọ dị mwute ka ndị mmadụ si ekwete ụmụ asịrị a na-eme ha obi mmapụ. Ọ sị ""ihe na-eme bụ, abalị niile i hụ ụmụaka ebe ha bụ ngwongwo n'isi agbapụ, n'ụtụtụ ha eburukwa lọta"". Ọ nweghị eziokwu tọgbọ na ya bụ asaịrị"". Ọ na-arịọ ndị Ebonyi ka ha jụọ oyi maka na ọnweghịzị ndị Fulani ọchie ehi nọ n'Ebonyi steeti. Odah sị na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọzu n'ọtụtụ ebe na steeti ahụ mgbe niile. Ọ sị na ndị uweojii hiwere atụmatụ ha kpọrọ ""Operation Fire for Fire"" maka ịkpochapụ ọgbaghara niile dị na Steeti ahụ. Ha nyekwara akara ekwentị onye ọbụla nwere ihe ọ hụrụ ga-eji kpọtụrụ ha. Ya bụ akara ekwentị bụ 070 645 15001. Ihe gọọmentị steeti Ebonyi kwuru Kọmishọna mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji bere arịrị maka ihe na-eme gbasara ya bụ egwu mwakpo. ""ihe anyị na-arịa na steeti a bụ asịrị sosha midia na-ebute"". Ọbụrụ na gọọmenti etiti amaghị ihe ha mere maka nchekwa soshal midia, o nwereike imebị anyị ihe"". Orji na-akọwa na ọ bụ shoshal midia na-ebute egwu a niile ndị mmadụ na-atụ. Ọ sị na ya bụ egwụ ha na-atụ enweghị isi na ọdụ. Ọ gwara ndị Ebonyi ka ha biwe ndụ ha nke ọma maka na ọ nweghị ihe na-eme. Ọ sị na ""ihe anyị na-eme ugbua bụ izipu ndị ọrụ anyị ka ha na-aga n'imeobodo ịkuziri ndị mmadụ uru ọ bara inyocha akụkọ ọbụla si na sochia midia. Ọ sịkwa na onwee ihe ọbụla onye ọbụla hụrụ ya kpokuo ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ. Kepu kepu anyị nụrụ na-ekwu na egwu mwakpo ndị Fulani na-achị ehi juru Ebonyi steeti niile ugbua. Abalị abụọ gara aga, ya bụ egwu bara ndị Amike-Aba ahụ, mere ụfọdụ ndị obodo ahụ jiri were abalị gbafuchaa be ha. Akụkọ anyị nụrụ ụbọchị Tọzde na-ekwu na kemgbe ahụ ya bụ kepu kepu agbasaala ọtụtụ ebe ndị ọzọ na steeti ahụ. Ọkwa dị mkpa: Ị chọrọ iso kwo okwu na mkparịtaụka BBC Igbo a kpọrọ 'Ka o si emetụta anyị'? Pịa ebe a ka i debanye aha gị: 👉🏽👉🏽👉🏽https://forms.gle/ZvmkveNdRXBsUsvh9" 42788739,https://www.bbc.com/igbo/42788739,Lassa fiva agbasawala ọzọ na Naịjirịa,Otu Dokinta ndị Kogi Steeti akpọrọ Victor Idowu agbabirila nwụọ n'aka ọrịa lasa fiva (Lassa Fever).,"Ọrịa lasa fiva (Lassa Fever) dịka ka ọ bụ ndị ọrụ ahụike ka ọchere aka mgba Otu jikọtara ndị dibịa oyibo bụ Naịjirịa Medical Association (NMA) kwuru na-onye otu ha nwụrụ n'ụlọ ọgwụ Irrua Specialists Hospital dị n'Edo Steeti n'ụbọchị Eke 22 Jenụwarị, 2018. Ndị otu a chọpụtara na Idowu butere ọria n'ihu ọrụ na mkpụrụ ụbọchị iri na itolụ nke ọnwa Jenụwarị. Ode akwụkwọ ndị NMA na Kogi steeti bụ Zubai Kabir sị na ""Ihe mgbagwojuanya bụ na onweghị onye ọzọ bubatara ọrịa n'ụlọ ọgwụ ahụ"". Nke a mere na onweghi onye tụrụ anya n'ụdị ọria ahụ dị n'ụlọ ọgwụ ahụ. Ya kpatara ha jiri gwọwa Victor Idowu ịba rụo mgbe ọgwụ ịba arụghịzị ọrụ. Mgbe ahụ ka ha jiri mee ya nnyocha wee hụ na ọ bụ lasa fiva (lassa fever) ji ya, were bụrụ ya gawa ụlọ ọgwụ ukwu dị na Edo Steeti, ebe ọ nọrọ nwụọ. Ka ọ dị ugbua otu nwaamadị bi na Lokoja bụ Idris Miliki Abdul sị na gọọmenti kwesiri igbabu mbọ n'ihu naezisara ozi maka ọrịa a na-enweghi ngwọta. Ọ sị na ""ọtụtụ mmadụ bi n'ime obodo amaghị ihe ekwe na-akụ maka lasa fiva (lassa fever)"" na ọbụrụ na-emeghị ngwangwa meghere ọdachị, na ya bụ ọria nwereike ịsụ ndị mmadụ akwụ. Chetakwa na ọrịa ahụ egbuola ndị dọkinta abụọ n'Ebonyi steeti n'izu gara-aga. Ndị dọkinta ahụ na ndị otu gwọrọ ndị bụ ọrịa ahụ bụtere ya bụ lasa fiva (lassa fever) ma nwụkwa na otu ụlọọgwụ ahụ n'Edo Steeti. N'ime izu ụka garaaga, lasa fiva (lassa fever) tara isi otu onye n'ime mmadụ iri na ise butere ọria ahu na Federal Medical Centre (FMC) Keffi, Nasarawa steeti. Ihe a bụ steeti ebe lassa fever rugoro n'Jenuwari afọ 2018 Akụko ka na-abịa" afirika-48229762,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48229762,Lee ka Kate Anorue siri napụ ndị ọcha ya bụ ọkwa wee gosi na nwanyi bụ ihe,Mayor Kate Anorue bụ onye Nanka dị n'Anambra Steeti meriri ndị ọcha nakwa ọtụtụ ụmụnwoke ya na ya zọrọ ochịchị n'Enfield ugboro abụọ.,"Ọ bu ụzọ chia site n'afọ 2012 rụo afọ 2013 mana ọ chiri nke ọma nke mere ka ahọpụtakwa ya ọzọ dịka onye ọchịchi Enfield ọzọ. Nanị ya bụ onyeisi ojii nke mbụ nọ n'oche ọchịchi a ugboro abụọ na mba Briten. Oriaku Kate hapụrụ Naijiria gaa obodo Britain n'afọ 1985. Ọ kọwara na nna ya kwesiri ike na nwaanyị ọbụla kwesiri igụ akwụkwọ dika umu nwoke nke mere na nna ya zụrụ ya na akwụkwọ nke ọma. Ndị obodo ya bụ Nanka Chiri ya ""Ada jere mba turu ugo "" n'afọ 2008. Ndị omeiwu Anambra Steeti kwanyere ya ugwu pụrụ iche site na ịmere ya nke bekee kpọrọ 'Valedictory Sitting' n'Awka. Lee ozi ekele ezitere Kate Anorue oge ahọpụtara ya dịka Mayor Enfield. Dịka Kaụnsul Enfield siri wepụta n'websait, Kate Anolue na ndị imeobi ya ga-anọ n'ọkwa ọchịchị ahụ afọ 2019/20. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ezi ozi ekele maka nturuugo ahụ. Otu APC na London kelere ya maka ibulie aha Naijiria elu n'ofesi nakwa maka ịbụ nwaanyị isi ojii mbụ a ga-eme 'Mayor' na mba Briten. @UchePOkoye sị na nwa afọ Anambra ọzọ etuterela Nigeria ugo na mba ofesi. Ihe ndị ịmaghị maka Kate Anolue 1. Anolue bụ nwafọ Nanka n'Anambra steeti 2. Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka 3. 'Ada Jere mba turu ugo' bụkwa onye 'midwife' nwetarala ọtụtụ nzere na Naijiria nakwa na mba ofesi 4. Anolue gara ebido ụwa ya dịka onye nkuzi mana Agha Biafra bụ ihe kwụsịrị ọzụzụ ya dịka onye nkuzi na Teachers Training College. 5. Ọ bụ onye anaghị ahụ mmanya ọkụ ma sorokwa n'otu ndị kweneyere na anaghị edetụ mmanya ọkụ ire bido oge ọ dị afọ 18 6. Anolue arụbuola dịka 'Mayor' of Enfield n'afọ 2012/13 Akụkọ ga-amasi gị:" afirika-43823175,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43823175,Lee onye e boro na aka ya dị n'ohi ọfọ ndị omeiwu sineti,"Ndị wakporo ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa ụnyaahụ so Sịnetọ Ovie Omo-Agege banye ụlọ ọme iwu ukwu ahụ, ndị hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa.","Ndịuweojii nwuchịkọrọ Omo-Agege, ma mecha rapu ya Onye ntaakụkọ Premium Times kwuru na ya so Omo-Agege n'azụ mgbe ọ na-aba n'ụlọ ome iwu ukwu, o kwukwara na mgbe ndị akpụ obi a rụru ebe ndi uweojii na-echekwa ebe ahụ nọ, Omo-Agege gwara ha na ọ bụ ya na ha so. Ndị uweojii ahụ hapụrụ ha niile ka ha gafe, agbanyeghị na ndị ome iwu machiri Omo-Agege ịbata ụlo omeiwu. Mgbe ndị a wakporo ebe ahụ, ma maburu ọfọ, onweghị onwe uweojii maọbụ ndị omeiwu kwụsịrị ha. Ndị omeiwu zọrọ isi ha ka ndị ike bịara buru osisi ọfọ ndị sineti Kedu etu ndụ akpụ obi siri wakpo ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa were buru ọfọ iwu ha gbapụ? Ajụjụ a bụ ihe ndị mmadụ na-ajụ na Naịjirịa ugbua ka akụkọ pụtara unyaahu na Ovie Omo-Agege, bu onye omeiwu na anọchite ndị Delta Sentraal n'ụlọ omeiwu ukwu kpọrọ ndị akpụ obi ga mabụrụ ọfọ. Onyeisi sineti bụ bukola Saraki anọghị oge mwakpo ahụ mere Ihe a na-egosi na nchekwa ulọ omeiwu ukwu adịghị etu okwesiri ị dị. Gụọ maka onye a asị na aka ya di na mwakpo a. Lee onye bụ Omo-Agege Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44233346,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44233346,Obiano: Kwakọrọnụ si n'Onicha na Ọka pụọ,Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano emechiela ndị ọgbatumtum ịgba n'Onitsha na Awka site n'abalị mbụ nke ọnwa Julịa.,"Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Onye tinyere aka n'ozi a bụ onye odeakwụkwọ ya na mgbasa ozi bụ james Eze n'ụbọchị taa bụ nke si ma mkpebi ndị isi ọchịchị steeti ahụ. Gọọmentị kwuru na""Mmachi ndị ọgbatụmtụm a bụ iji belata mpụ na ohi dị n'Onicha (Onitsha) bụ obodo isi azụmaahịa nakwa Oka(Awka) bụ isi obodo steeti"". Ndị isi ọchịchị gaara n'ihu nye ndị bi na gburugburu akwa mmiri Niger abalị mbụ nke ọnwa Ọgọsụtụ ka ha kwakọrọ pụọ n'otu aka ahụ. Ọgbatumtum bụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ iji eme njem Ha kwuru na a ga-akutusi ụlọ ndị dị na gburugburu akwa ahụ, iji nyocha ihe ndị omekaome na-eme aba ahụ. Gọọmentị kwuru na oge enyere ndị a bụ ka ha nweike nghazie onwe ha tupu gọọmentị amalite ọrụ ịzaacha na ikpocha Anambra Steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" 42805194,https://www.bbc.com/igbo/42805194,Lasa fiva na Naijiria: NCDC ewepụtala ọtu gbanụ gbanụ,"N'aha Mịnịstrị ahụ ike, ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi, Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) na aha bekee ọrịa ewepụtala otu ndị ọrụ gbanụ gbanụ ma ziga ha na steeti ndị e nwere lasa fiva.","Mgbasa ozi maka lasa fiva nke ndị NCDC mere n'Ebonyi Steeti NCDC zigara ndị ọrụ gbanụ gbanụ na Ebonyi, Ondo and Edo Steeti maka ịchịkọta mbọ maka ịchụpụ ọria ahụ, ịchọ ndị hana-ndị bu ọrịa mekọrịtara, ịgwọ na ịgbochi oria ahụ. Ha mere ka nke a pụta ihe n' akwụkwọ ozi ha zitere BBC kwuru na ha ezipula ngwa ọgwụ na-ihe ndị ọzọ eji enyere ahụ ike aka na steeti ndị ahụ. NCDC na ndị WHO, Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ ugbo,na Irrua Specialist Teaching Hospitalna-ejịkọ aka ikwado ịgba ọgụ ọria lasa fiva a. Ndị ọzọ bụkwa African Field Epidemiology Network, US Centers for Disease Control, University of Maryland Baltimore (UMB), Alliance for International Medical Action (ALIMA) na ndị ọrụ ndị ọzọ. Ọnụnụ ọgụgụ metụtara lasa fiva NCDC kọwapụtakwara na kemgbe mbido afọ 2018, enwela nsogbu ọria lasa fiva otu narị na asaa n'ime steeti iri; Edo, Ondo, Bauchi, Nasarawa, Ebonyi, Anambra, Benue, Kogi, Imo na Lagos Steeti. Tutu rue ụbọchị iri abụọ na otu ọnwa Jenụwarị, 2018, enwela ọria lasa fiva doro anya iri isii na otu nke mmadụ iri na isii bụ ndị nwụrụ anwụ. Ndị ọrụ ahụ ike iri bụ ndị ọria nweterela na steeti anọ(Ebonyi - 7, Nasarawa - 1, Kogi - 1 and Benue - 1), ebe Ebonyi Steeti nwere mmadụ anọ bụ ndị nwụrụ anwụ. Akwụkwọ mgbasa ozi maka lasa fiva NCDC dọra ndị ọrụ ahụ ike aka na ntị ka ha ke nkwucha na-inyocha ọrịa ahụ ọkụ ọbụla dịka ọ kwesiri. N'ụtụtụ ụbọchị afọ, onwa Jenụwarị, gọọmentị Anambara Steeti machiri ndị mmadụ ịṅụ garị." 42941643,https://www.bbc.com/igbo/42941643,Jacob Zuma ekweghị ịrịtu n'ọkwa,Ozi si Saut Afrịka apụta na akọwa na onyeisiala ha bụ Jacob Zuma ekweghị ịrịtu n'ọkwa dịka otu ndi otu ya bu ANC siri cho.,"Zuma gbadoro ukwu na ala si na ya ama rịtu n'ọkwa. Zuma na mmadu isi bu ndị kachasị nwe ọkwa na ANC nwere nzụkọ ụnyahụ na beya na Pretoria. Nzụkọ bu ka ha were kwuo maka otu Zuma ga esi were rapụ ọkwa n'udo. Mazi Zuma di afọ iri asaa na ise, ma bụrụ onye a na ebo ebubo maka mpụ na awụwọ. Onye na ahazi ka o nochịe anya Zuma bu Cyril Ramaphosa, bu onye ndị ANC họpụtara ka onye isi na afọ gara aga. Ramaphosa bụ osote onyeisiala Saut Afrịka ụgbụa. Ndị na ahazi ihe na ANC a na-akpọ National Working Committe ga eme nzụkọ pụrụ iche iji kwu maka Zuma taa. Ana atu anya na ha ga elebanye anya ụzọ aga esi wopu Zuma, nke nwerike imetụta aka na isi ndi ome iwu tinye ọnụ na okwu a." afirika-49398182,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49398182,Ike Ekweremadu atụọla ụkwụ na Naịjirịa,Sịnetọ Ike Ekweremadu alọtala na Naịjirịa ka ndị Ipob wakpochara ya n'obodo Jamini n'ụbọchị Satode n'ebe a na-eri ji.,"Sịnetọ Ekweremadu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ụfọdụ ndị kpara ajọ agwa a. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya agbagharala ha. Cheta na ọ bụ n'obodo Nuremberg ebe otu Ndi Igbo Germany na-eme emume iri iji ha nke a kpọrọ Ekweremadu oku dịka onyeisioche. N'akụkọ yiri ibe ya,otu Ndị Igbo Jamini akatọọla agwa Ipob kpasịrị Sinetọ Ike Ekweremadu mgbe ọ bịara iri ji n'obodo Nuremberg ụbọchị Satọde N'ozi si n'aka onyeisi ha bụ Ozofor Ogechukwu, ha rịọrọ Ike Ekweremadu mgbaghara ma kwuo na Ipob ga-atakụta ya aja maka ihe ha mere. N'otu aka ahụ, ụlọ ọrụ na ahu maka mkpo Jamini na Naịjirịa ekwuola na ndị kpara mkpa mkpa ga-ezute iwu mba ahụ. Nke a mere ka Ipob na ekwu na ha ka ga-eme ọzọ. Ngagharịiwe 'RevolutionNow' Otu kpọrọ onwe ha RevolutionNow emeela ngagharịiwe ọzọ na Legọs ka gọọmentị tọhapụ onyeisi ha bụ Omoyele Sowore Cheta na anwụchiri Sowore n'izuụka ole na ole gara aga maka na ọ chọrọ ịhazi ngagharịiwe N'ofesi Ụgbọelu agha mba Syria atụọla ogbunigwe n'ụgbọla agha ndị si mba Tọọkị aga obodo dị n'aka ndị ekweghịekwe Syria. Ndị Tọọkị na-ekwu na mmadu atọ nwụrụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara. Anyị ga-eme BBNaịjia nke anyị - Gọọmentị etiti Gọọmentị Naijirịa ga-amalite ime emume nkiri nke ha dịkwa ka Big Brother Onye kwuru nke a bụ onyeisi ngalaba National Council of Arts and Culture bụ otunba Segun Runsewe. Ọ sị na akwamiko a na-ame na emume Big Brother amasịghị omenala Naịjirịa nke mere ha ji ahazi nke ha ga-akwalite omenala." afirika-45617683,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45617683,Kedu ebe Nnamdi Kanu nọ? Ihe Geoffrey Onyeama kwuru,Onye ntaakụkọ aha ya bụ Simon Ateba na arụ ọru na ulo ntaakụkọ Today News Afrịka jụrụ Geoffrey Onyeama maka onọdu Nnamdị Kanu n'ime ajụju ndị ọzọ ọ jụrụ.,"Geoffrey Onyeama asịghị na ya ma ebe Kanu nọ Mgbe Maazị Onyeama tinyere ọnụ na ya bụ okwu, ọ gaghị i'ihu saa ya etu esi juo ya. Kpọpụtanụ Nnamdi Kanu - Ọkaiwu ya Gọọmenti etiti na-atụ asị-Nwunye Kanu 'Nwunye Kanụ na-arọ nrọ' Ọ sị na ya gụrụ akụkọ n'ụtụtụ ahụ ebe onye bụbụ gọvanọ Imo steeti bụ Orji Uzọ Kalu kwuru na Maazi Kanu nọ na Briten na-ezu ike. Maazi Onyeama nwere ịza ajụjụ ahụ mee ihe ọchị mgbe ọ sị ka ndị ntaakụkọ ekwukwana na ya kwuru makana ọbụghi ya kwuru. Cheta na Kemgbe afo gara aga ebe Nnamdi Kanu nọ bụ ihe ọtụtụ mmadu na-acho ịmata. Onwere ndị na-asị na ọ nọ n'ime ụgbọmmiri, nwekwa ndị sị na ọ nala mmụọ, ka ndị ọzọ, dịka Orji Kalu, na-ekwu na ọ na mba Briten, bụ ebe onwere akwụkwọ dịka nwaafọ. Ndịagha Naịjirịa, bụ ndị ndị Ipob (otu Kanu) na-ebo na ọ bụ ha ma ihe mere nwa Amadị a, na-ago aka na ukwu na ha amaghị ọnọdị ya. BBC Igbo jụrụ nwunye Kanu ma ọ ma ebe di ya nọ mgbe ụlọ ntaakụkọ a na ya nwere mkparịtaụka, lee ihe okwuru ebe a: Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Gọọmentị Naịjirịa sakwara ebubo nwunye Kanu boro ha na aka ha dị n'ihe mere di ya mgbe Lai Mohammed gwara ndi ntaakụkọ BBC na 'nwunye Kanụ na-arọ nrọ'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42816414,https://www.bbc.com/igbo/42816414,Zinedine Zidane nọọzi n'oche ọkụ na Madrid,Zinedine Zidane ekwuola na o jịzi ndidi agafe oge ọnọdụ ọjọọ ọ na-agafe ugbua dịka onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid.,"Zidane amabutala iko asatọ dịka onye nkuzi otu Real Madrid Ọnọdụ ya dịka onye nkuzi otu egwuregwu ahụ ga-agbado ụkwụ na ndị otu ya ime nke ọma n'asọmpi Uefa Champions. Nwafọ mba France a kwuru: ""Ọ bụ ihe mgbakwoju anya."" "" Nke a bụ oge kachara m njọọ dịka onye nkuzi. Enweghị m obi abụọ gbasara ihe ọbụla mere n'asọmpi a. A na m anara ụta maka ihe ọ bụla mere."" Madrid jiri otu ọkpụ gọọlụ merie na ụkwụ nke mbụ n'asọmpi ahụ, ebe ejiri ọkpụ abụọ asatara otu merie ma gbapụ ha n'ụkwụ abụọ n'asọmpi Copa del Rey. Tebụlụ ogogo La Liga Mgbe ajụrụ ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya na Madrid, o kwuru na ọ ga-abụ ma ha mee nke ọma n'asọmpi Uefa Champions. ""Otu anyị jiri bido asọmpi a adịghị mma, maka nke a obi adịghị m nma. Amaghị m ihe na-eme."" Aga m achọta ụzọ anyị ga-eji pụta na nsogbu a. Anyị achọtala ụfọdụ." afirika-48918945,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48918945,Imo state news today: Ụmụnne atọrọla nna ha dị afọ 88,Aka akparala ụmụnne abụọ aha ha bụ Chinaza Nwogu na Emeka Ejike nakwa enyi ha nwoke bụ Emmanuel dịka ha tọrọ nna ha dị afọ iri asatọ na asatọ n'Imo steeti.,"Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu ya nọ n'Imo steeti nwụchiri ha n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa June ka mmadụ zitechara ha ozi. Kedụ ka o si mee? Mba kwuru na enyi ụmụnne abụọ ahụ akpọrọ Emmanuel kwadoro iji ego ọ ga-eketa na ya bụ ntọ nna ha we bịa lụrụ otu onye n'ime ha. O kwuru na a na-eche na mmadụ atọ a na-atọbu ndị mmadụ maka ịnapụta ego na mpaghara Mbaise. N'ebe ọzọ n'Imo steeti Mba kwukwara na ndị uweojii tọghapụrụ ndị mmadụ ndị ntọ ji ruru iri na atọ n'ọhịa Ohaji/Egbema dị n'Imo steeti. O kwuru na ndị uweojii gburu ndị ntọ atọ ka ha na ha kwachara mgbọ n'ọhịa ahụ ruo awa asatọ. Mba kwuru na ha nwụchiri otu onye a na-eche na o gburu nwa ada ka fechara ala nna ya na Naịjirịa ka ọ wakpochara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Etu nwoke akpọrọ ""Nigeria's Supercop"" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa." afirika-49672614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49672614,"Gernot Rorh: Nne onye nkuzi ndị ""Super Eagles"" alaala mmụọ.","Arịrị juputara n'obi Gernot Rohr bụ onye na-akụziri ndị otu egwu bọọlụ ""Super Eagles"" nke Naịjirịa.","Gernot Rohr na nne ya, Elizabeth Nke a bụ maka ọnwụ nne ya bụ Elizabeth Rohr onye gbara afọ iri itoolu na asaa tupu ọ laa mmụọ. Ndị nchịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjiria bụ ""Nigeria Football Federation"" tiri Rohr aka n'obi n'akara Twitter ha. End of Twitter post, 1 N'aka nke ọzọ, otu NFF ekwuola na ha anabatala Salisu Yusuf ma tinyeghachi ya dịka onye isi nkuzi bọọlụ ndị ""Super Eagles"". Yusuf laburu ntaramahụhụ otu afọ maka ịna aka azụ. Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego Ụlọọrụ BBC gbara Yusuf n'anwụ n'ihi ịna aka azụ otu puku dọla iji họrọ ndị ọgba bọọlụ ụfọdụ ka ha soro na asọmpi ""African Nations Championship"" na 2017. Ndị gbara ọsọ ndụ na Saụt Afrịka Ụmụ Naịjiria si Saụt Afrịka gbalata, na-ekwu ọ bụ kamgbe Nelson Mandela nwụchara ka ndị mba ahụ ji malite imekpa ha ahụ. Ejike Okoro bụ otu n'ime ndị so ụgbọelu Air Peace wee gbalata kwuru nke a oge ya na BBC nwere mkparịta ụka. Okoro, onye na-arụ ọrụ aka sị na ọnọọla na Saụt Afrịka ihe ruru afọ itoolu. Ya na ndị ọzọ so were lọta buuru ụkpa ekele bunye Allen Onyema onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace nakwa gọọmentị etiti maka ịbịa zọpụta ha. Mmadụ 22,000 na-efu efu Ụmụaka bi n'ebe ndị gbara ọsọ ndụ na-ebi na Adamawa Steeti Ihe ruru mmadụ puku iri abụọ na abụọ ka a na-achọ achọ n'ihi mkpamkpa ndị otu Boko Haram na-akpa na mpaghara ugwu Naijiria. Dịka ndị otu Red Cross si kwuo, imirikiti n'ime ndị a na-efu efu bụ ụmụaka nke pụtara na ọtụtụ ndị nne na nna amaghị ma ụmụ ha a dị ndụ ka ha anwụrụ anwụ. Peter Maurer, onye isi ndị Red Cross n'ụwa niile kwuru na nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ha dekọwara aha ndị na-efu efu na mba dị iche iche n'ụwa a. O kwukwara na ndị otu ya achọtala mmadụ ruru 367 ma kpọghachi ha n'ezinụlọ ha. Olili Mugabe Gọọmentị Zimbabwe ebe ha na-akwanyere Mugabe ugwu dịka aka chịbụrụ ala ahụ Onye nwụọ ọ ga zuru ike, mana Robert Mugabe, aka chịburu mba Zimbabwe, ezubeghị ike dịka ezinaụlọ ya na gọọmentị mba ahụ na-azọ ebe a ga-eli ya. Ezinaụlọ Mugabe na-eti mkpu na ọ bụ na ebe e liri nna nna ha ka a ga eli ya, mana gọọmentị na-ekwu na a ga-eli Mugabe ebe a na-eli ndị dike obodo ji biri. Robert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ Ndị be Mugabe gbarụrụ ihu na gọọmentị ajụghị ha ese mgbe a na-akpa maka olili nna ha. Ka ọ dị ugbua, e kpebiela na a ga-eli Mugabe n'obodo ya. Ngagharịiwe maka ụkọchukwu egburu Ndị uka na Kaduna steeti emeela ngagharị iwe gbasara onye ụkọchukwu ha ndị omekome gburu na okpuruọchịchị Jema dị n'ọdịda anyanwụ steeti ahụ. Egburu Alhamdu Mangadus n'ụgbọ ya ụnyahụ, dịka onyeisi ndị otu Christain Association of Nigeria bụ Joseph Hayab si kwuo. Maka ọsọ ndụ na Saụt Afrịka Mmadụ dị otu narị na iri asatọ na asaa nke Airpeace butere bụ ndị gbara ọsọ ndụ gbara ụkwụ na Murtala Mohammed Airport n'abali Wenzde. Onye na ahụ maka mmekọrịta Naijirịa na mba ọzọ bụ Abike Dabiri sị na ọ bụ ihe ihere na ndị isi ojiri ka na egburita onwe ha ma na agbanyeghị, na Naịjirịa ga na-ekpe udo. Boko Haram awakpola obi ndị agha Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndi agha nọ Borno steeti agbala ama na ndị omekome Boko Haram wakporo obi ha dị na Gudumbali gburu mmadụ itoolu, ebe Mmadụ iri abụọ na isi ndị ọzọ na-efu efu Ọnụ na-ekwuru ndi agha bụ Sagir Musa kwenyere na mwamkpo a mere mere ụbọchị Tuesday mana ya amaghị maka ndị egburu. France emeela Amerika ntọọ na Basket bọọlụ France erubeghi isingwucha egwuregwu a mbụ mana ha gbatala ndị nke atọ na 2014 N'egwuregwu, France anarala Amerika ụra rahụ na-egwu ha ma agba bụ basket bọọlụ na asọmpi iko mbaụwa Basket bọọlụ a turu na China ụbọchi Wenezde. France banyegoro agba nke anọ ji ọkpụ iri asatọ na itoolu (89)merie ndị Amerika bụ ndị tụtara nkata iri asaa na itoolu (79). Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52345625,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52345625,Igbo Mythology: Etu Igbo si malite ịgu ụbọchị anọ dịka izu,"Afọ, Eke, Orie na Nkwọ bụ ụbọchị anọ mesuru otu izu n'omenala Igbo.","Abalị anọ bụka ụbọchị ahịa nke pụtara na oge gbua, obodo di iche iche na-ahọrọ oge nke ga-abụrụ oge ahịa be ha. Otu obodo ghọrọ Eke, ọzọ ahọrọ Orie. Etu a obodo dị iche iche a na-emekọrịta dịka ha na-azụkọ ahịa. Mana gịnị bụ mmalite ụbọchị anọ a? Ole ndị manyere ya? Kedụkwanụ mgbe o ji bido? Gịnị mekwaranụ o ji dị oke mkpa rue taa? Ị zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-alaghachi azụ n'oge gboo. Onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara nkọmịrịkọ na omenala Igbo bụ Ọkankuzi Chiagozie Nnabuihe du anyị ga njem a. Etu ụbọchị ahịa anọ si pụta ihe Maazị Nnabuihe kọwara na mbido ụbọchị ahịa anọ bụkwa izu Igbo dị n'ime nkwenye ndị Igbo. N'ọnụ ya; ""Ndị Igbo kwenyere na Chukwu kere ụwa nakwa ihe niile anya ha na-ahụ, ha kwenye kwara na o kere ụwa okirikiri"". Mgbe o kechara ụwa, o nyere anywanwụ iwu ka o si n'aka nri letara ya ụwa rue n'aka ekpe. Nke ahụ mere anyanwụ ji kewaa ụwa ụzọ abụọ akpọrọ ọwụwa anywanwụ na ọdịda anywanwụ. Chukwu gwakwara ọnwa ya letara ya ụwa site na ugwu rue na ndịda. Ọnwa esorokwa nzọmụkwụ anyanwụ were kewaa ụwa ụzọ abụọ nke ya pụtara ugwu na ndịda. Njekọ ọnwa na anywanwụ kewaziri ụwa ụzọ anọ were weputa ikuku ụwa anọ nke akpọrọ Ọwụwa anyanwụ, ọdịa anyanwụ, ugwu nakwa ndida. Nkewa a bụkwa iji nweta nhatanha ebe na oge nke pụtara ""space and time"" na Bekee. Ọ bụ ebe ahụ ka esi nweta ụbọchị anọ nke ahịa nakwa izu Igbo. Ọkankuzi Nnabuihe kwukwara na ụwa niile ndị Igbo kwenyere na ya dị ụzọ anọ N'ọnụ ya ""anọ ka ọ dị n'Igwe, anọ ka ọ dị na be mmụọ, anọ ka ọ dị na be mmadụ"". Akụkọ ndị ọzọ kwanụ? Ego ayoro Ụfodụ akụkọ gbalịrị ịkọwa mmalite ụbọchị ahịa ndị a dịka akụkọ gbasara Eze Nrijiofor nke Nri nakwa ndị ọbịa anọ bịara n'obieze ya. Ọkankuzi Nnabuihe kọwara na nkọmịrịkọ Igbo ọbụla na-enwe ihe akaebe ndị a na-akọrọ ya ga-eji ghọta ya mana ọ dịghị n'akụkọ Eze Nrijiofor nke mere na o nweghi eziokwu dị na ya. Akụkọ Eze Nrijiofor ahụ kwuru na ọbịa anọ gara n'ọbieze Nrijiofor ma rue n'abalị kwuputa aha ha bụ Eke Afọ Orie na Nkwọ. N'ụtụtụ ha mechara saa ihu, kwọ aka, gọrọ Eze Nrijiofor ọjị ma bunye ya ite mmiri anọ sị ya debe ya n'ihu ụlọ alụsị dị n'obu Gad na Nri. Mana Nnabụihe si ka a jụọ onye depụtara akụkọ a na ""ọ bụ mgbe a mụrụ Eze Nrijiofor ka ụwa malitere?"" Ọsịsa ajụjụ a ga-egosi ma akụkọ a abụ eziokwu ka ọ na ọbụghị." afirika-44162390,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44162390,Akụkọ kachasị taa: Buhari na Ali-modu Sheriff zutere onwe ha taa,Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a: Onyeisiala Buhari na Ali-modu Sheriff nwere mkparịta ụka,"Mohammdu Buhari na onyeisi ala Amerika Donald Trump enweela ọgbakọ Onyeisiala Mohammadu Buhari na onye bụbụ onyeisi oche otu PDP bụ Ali-modu Sheriff nwere mkparịta ụka ime ụlọ n'ụlọọrụ onyeisiala na'Abuja taa. Cheta na ụlọikpe chuturu Sheriff n'ọkwa onyeisis oche ndị PDP n'afọ gara aga, mana ọ laghachiela APC. Otu Restoration ndị APC Imo Steeti akatọọla Rochas Okwu ka na-arị ibe ya elu n'ime ntụliaka ndị otu APC Imo Steeti mere n'izuụka gara gaga. Dịka otu kpọrọ onwe ha Restoration group nke onye ndụ ha bụ TOE Ekechi kwuru na ndị Imo Steeti niile ajụla Gọvanọ Okorocha. Akụkọ ofesi Oke egwu ji ndị mba DR Congo ugbu a dịka ọrịa ebola nke dị n'otu ime obodo abatala n'otu obodo mepere emepe akpọrọ Mbandaka. Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba DR Congo bụ Oly Ilunga Kalenga kwupụtara nke a. N'Egwuregwu Naịjirịa ka nọ n'ọkwa iri anọ na asaa na ndị kacha agba bọọlụ na mba ụwa nille nakwa ọkwa isii n'Afrịka. Nke a dị n'ogogo otu egwuregwu bọọlụ ndị Coca Cola na FIFA wepụtara taa. Gee ya nkeji nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Ihe ndị ""Restoration Group"" kwuru" afirika-46114552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46114552,"Minimum Wage: Buhari ga-eleba anya n'ịkwụ N30,000","Gọomentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-elebanye anya n'ihe gbasara N30,000 bụ ego NLC chọrọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.","Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputere nke a na nzukọ ya na otu akpọrọ ""tripartrite committee"" n'asụsụ Bekee nwere n'Abuja taa bụ Nọvemba 6, 2018. Buhari kwuru na ọ ga-ezigara Ụlọomeiwu Naịjirịa akwụkwọ gbasara mkpebi a. Ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmed, tinyere ihe nkiri si na nzukọ ha n'elu Twitter ya. End of Twitter post, 1 N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, zipuru ozi ihe Buhari kwuru na nzukọ a. Gụọ ha ebe a: N'akụkọ ọzọ, Ndị ụlọomeiwu ukwu enyela ngalaba ha na-ahụ maka ndị uweojii, iwu ka ha mee nyocha gbasara mwakpo a wakporo ụlọ osote onyeisi ha bụ Ike Ekweremadu. Osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila agala ịhụ Ekweremadu Cheta na a nwụchiri otu nwoke bu egbe banye n'ime ọnụụlọ Ekweremadu, n'ụtụtụ ụbọchị Nọvemba 6, 2018. Gụọ ya n'uju ebe a: Ekweremadu: Ụlọomeiwu chọrọ ime nyocha Abụbọ-ọrụ ASUU Ọkammụta Ogunyemi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnma ndị nkuzi na mahadum bụ ASUU, kwuru na ụfọdụ nkwa gọọmentị kwere otu ha na-emezughi emezu n'afọ 2009, so n'ihe ha na-ana gọomentị ruo ugbua. Ọ gwara BBC Igbo na ndị ASUU mahadum ruru iri isii bịara nzukọ ha mere, ebe ha kwekọrịtara na ha ga-esonye n'abụbọ-ọrụ a ma hụ isi ya. Na mba ofesi, Amerịka emeela ntuliaka 'mid-term' ha ga-eji họpụta ndị ụlọomeiwu ukwu, nke nta na gọvanọ steeti iri atọ na isii. Ndị mmadụ ebidola ịtụ vootu Otu nwaafọ Igbo bụ Nnamdi Chukwuocha so na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị, ebe ọ na-ele anya ịnọchite anya ndị obodo Delaware. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Nnamdi Chukwuocha: Nwaafọ Igbo na-azọ ọchịchị n'Amerịka N'egwuregwu Champions League, Barcelona na Inter Milan ga-ama onye ike ga-agwụ mgbe ha zutere n'Itali, Ebe PSG na Napoli, Tottenham na PSV Eindhoven, Atletico Madrid na Borussia Dortmund nakwa Liverpool na Red Star Belgrade ga-akụkọtakwa mpi. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: ndị ishi na-agụ egwu" afirika-43182253,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43182253,Ugboro ole ka ị na-asa eze n'ụbọchị ?,"Na nnyocha emere mmadụ puku abụọ na Amerịka, a chọpụta na ""otu n'ime ụzọ atọ ndị gbara afọ 18-34 na-asa eze sọ otu ugboro n'ụbọchị, ebe ụfọdụ anaghị asa ruo abali abụọ.","Ndị ọkachamara ahụike eze kwuru na o kwesịrị ka a sa eze ụgbọrọ abụọ n'ụbọchị Nchọpụta ahụ kwukwara na ọbụladị n'okenye, ọtụtụ anaghị eleta eze ha, ebe ndị dị pacenti iri isii na abụọ na-atụ ụjọ ị ga-hụ dọkịta na-ahụ maka eze. Onye dọkịta na-ahụ maka eze bụ Olabode Ijarogbe gwara BBC na o kwesiri ka mmadụ taa atụ ugboro abụọ n'ụbọchị. Ijarogbe onye bụ onyeisi otu ndị dọkịta na-ahụ maka eze na Naijiria akpọrọ 'Nigerian Dental Association' na bekee sị: ""Ụgbọrọ abụọ kwa ụbọchị; ma i richa nri ụtụtụ na ikpeazụ tupu ịlaba ụra. Ihe ndị mmadụ na-emekarị bụ ịsa eze ọzigbọ ha tetera ụra."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụfọdụ ndị ndị ntaakụkọ anyị jụrụ ugboro ole ha na-asa eze n'ụbọchị kwuru na ọ bụ otu ugboro. Otu okorobia a kpọrọ Chris Nas dị afọ ịrị atọ zara sị: ""Otu ugboro n'ụbọchị. Ma mgbe ụfọdụ, e nwere m ike ghara ịsa ya otu abalị aga."" Dkta Ijarogbe kwuru na-agbasoghị usoro kwesiri iji lekọta eze nwere ike ibute ọrịa dị icheiche dịka eze ure(nke a kpọrọ dental caries), eze isi, anyụrụeze ịza aza(nke a kpọrọ periodontal disease) na ọnwụ. Dịka Dkta Olabode Ijarogbe siri kwuo,ọ bụrụ na agwọghị ọria eze, o nwere ike igbu mmadụ. ""Ọtụtụ ihe ndị dị na-akụkụ ahụ ndị ọzọ dịka agbara na anụahụ dị n'eze nke bụ na ihe metụtara eze, ọ bụrụ na onweghị ihe e mere ya, mmadụ nwere ike isi na ya nwụọ.""" 42696304,https://www.bbc.com/igbo/42696304,Armed Forces Remembrance Day: Ka o si aga,Afọ iri anọ na asatọ agafeela kamgbe ndị agha Naịjiria na ndị agha Biafra chiliri aka elu ma kweta ịkwụsị ọgụ agha obodo (civil war) nọ na-achọ ịdọsa ndịnotu mba Naijiria.,"Ndị agha Naijiria na-alụ agha na ndịda-owuwa anyanwụ ịkwụsị ndị Boko Haram Gọọmentị etiti Naịjiria ji maka ichili aka a, tinye ụbọchị jenụwarị iri na ise n'afọ ọbụla maka ncheta ndị nwụrụ n'agha maka Naịjiria. Ha na-echetakwa ma ndị agha ka dị ndụ na ezinaụlọ ndị nke nwụrụ anwụ. Ụbọchị Fraide tupu emee ncheta a, ndị alakụba na-enwe ekpere juma'at. Sụnde, ndị ụka emee ekpere n'ụlọ ụka. Na ụbọchị mmemme ncheta, onye isi ala, osote ya, ndị dị mkpa na gọọmentị etiti na ndị isi nche dị iche iche na Naijiria ga-atụkwasị ahịhịa akpara-akpa n'ụkwụ ihe akpụrụ akpụ n'anọchite anya ndị agha nwụrụ anwụ edepụtara aha ha, n'Abuja. End of Twitter post, 1 Na gburugburu steeti iri atọ na isii dị na Naịjiria, ndị isi na ndị isi ndị nche ga-agbakọkwa tụkwasị ahịhịa n'ụkwụ onye agha akpụrụ akpụ, iji gosi 'onye agha a na-amaghị aha ya. A na-agba egbe ugboro iri abụọ na otu, gba nkịtị ka otu nkeji gafee ma hapụ kpalakuku ka ọ felie, iji gosi udo. Onye isi ala ga-abịa nyochaa nche nke nsọpụrụ (guard of honour) nke ndị agha ga-edowe ebe ahụ. Onwere akara a na-eyi n'uwe ndị gọọmentị etiti na-ewepụta; a na-ere ya were ihe erepụtara ji tinye aka ịkwado ndị agha lara ezumike nka." egwuregwu-43730088,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43730088,Uefa: Ihe ịtụ n'anya onwere ike ime Madrid?,"N'asọmpi Uefa champịọns ụnyaahụ, ihe ịtụ n'anya mere Barcelona mgbe ndị Roma gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa champịọns.","Real Madrid ji ọkpụ atọ asataghị otu merie ndị Juventus n'ụlọ ha n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ. Ndị Barcelona jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Roma n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ, ebe Roma n'ihe iju anya jiri ọkpụ atọ chara acha merie ma gbapụ ha. Ajụjụ a bụrụ, ihe mere ndị Barcelona onwere ike ime ndị Real dịka ha ga-ezute ndị Juventus n'abalịa. End of Twitter post, 1 Real Madrid ji ọkpụ atọ asataghị otu merie ndị Juventus n'ụlọ ha n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ. Juventu ga-enyeru Real Madrid ọkpụ atọ agaghị asata otu iji merie ma gbapụ ha n'asọmpi nke abalịa. N'aka nke ọzọ, Bayern Munich ga-ele ndị Sevilla bụ ndị ha jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie n'ụkwụ nke mbụ ọbịa n'ụkwụ nke abụọ taa. A na-atụ anya ma otu ihe ịtụ n'anya ahụ ọ ga-emekwa ọzọ n'abalịa mgbe ndị otu a ga-ezute ibe ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49018420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49018420,Donald Trump on Iran: Ndị mba Iran na-atụ 'asị ọcha' maka CIA,Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola sị na akụkọ ndị Iran na-akọ na ha agbabọọla ọrụ nzuzo ndị Central Intelligence Agency (CIA) bụ asị ọcha.,"Ndịisi na Tehran bụ isiobodo mba ahụ kwuburu na ha nwụchiri mmadụ iri na asaa bụ ndị mba ha ha na-enyo na ha bụ ndị ọrụ CIA, ma maa ha ikpe ọnwụ. Lee ihe o dere n'elu Twitter ya: End of Twitter post, 1 N'egwuregwu, Antoine Griezmann ka banyere Barcelona kwuru na etu ndị otu ọhụrụ ya si agba bọọlụ na-amasị ya. O kwuru na ọ ga-amasịkwa ya igbanwe etu o si agba bọolụ ka o nwee ike ị na-eme etu ibe ya mere. Udele nwụrụ n'Enugwu steeti Ndị na-azụ ahịa n'Eke Ihe dị n'Awgụ, Enugwu steeti, ekwuola na ọ bụ eziokwu na udele karịrị ọgụ dara otu mgbe n'ahịa ahụ ma nwụọ, kamana ọ bụghị anụ ha riri gburu ha. Otu onye Ihe gwara onye ntaakụkọ BBC na a na-enyo na o nwereike bụrụ na achịnyere ụtaba n'ime eriri afọ ehi e wepụtara n'ime ehi ahụ nwụrụ anwụ, nke udele ndị ahụ riri tupu ha anwụọ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọ bụghị anụ ehi gburu udele nwụrụ n'Eke Ihe dị n'Enugu state Ngagharịiwe ndị Shiites Ndị uweojii arịola ka ndị Ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ dịka ndị Islamic Movement of Nigeria (IMN) a na-akpọ Shiites na ndị uweojii takọtara isi ọzọ n'Abuja. Nke a bidoro dịka ha na-eme ngagharịiwe ka gọomentị tụhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaki eji na mkpọrọ kemgbe afọ 2015. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị Shia na ndị uweojii na-akwata ya n'Abuja Onyeisiala Naịjirịa agọrọla aka na ụkwụ ya Amabeghi mgbe Buhari ga-alọa na njem o mere gaa London Onyeisiala Naịjirịa agọrọla aka na ụkwụ ya n'okwu na-efegharị na ọnọdụ nchekwa ndụ na akụ mmadụ emebiela kpam kpam na Naịjirịa. Onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala n'okwu mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuru nke a mgbe ụlọntaakụkọ Channels gbara ya ajụjụ ọnụ. Shehu kwuru na udo dị na mpaghra ugwu nakwa na Niger Delta dịka ụmụ Naịjirịa na-ebeku goomentị ha kwụsị oke ogbugbu na-akpọtụ ebe niile. N'akụkọ yiri ibe ya gọọmentị Naịjirịa asaala otu PDP maka ebubo imefu otu ijeri dọlla nke si n'akapego Naịjirịa amapụtara maka ịbuso ndị Boko Haram agha. Garba Shehu kwuru na ebubo ahụ enweghi isi ma gaa n'ihu kọwa na esi n'ego ahụ zụọ otu ụgbọelu ọgụ ma debe ego nke fọrọ na ya. Na mba ofesi, Akụkọ si na mba Kongo apụta n'ụtụtụ a na-ekjwu amachiela ọgbakọ ndọrọndọrọ ọbụla n'isi obodo mba ahụ bụ Kinshasa. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ bụ AFP si kwuo, nke a bụ maka esemokwu dị n'etiti ndị nso otu ndọrọndọrọ dị icheiche. N'egwuregwu, Aka chiburu otu Super Eagles bụ Bonfrere Jo ekwuola na ndị ọgba bọọlụ Naịjirịa ndị obere nwereike ịbuli otu Super Eagles elu maọbụrụ na eleta ha ma kuziere ha ọfụma. O kwukwara na Naịjrịa nwere odogwu kwuru odogwu n'ịgba boolu na Naijirịa. Akụkọ BBC Igbo na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-48637928,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48637928,"Chika Ike: O nweghị sakramenti jikọọ mụ na Ned Nwoko, di Regina Daniels",Chika Ike bụ ome ejije Nollywood ekwuola na o nweghị eiokwu dị na-akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya na di Regina Daniel bụ Ned Nwoko na-eme enyi.,"Chika Ike,Ned Nwoko,Regina Daniels Kepukepu na-efegharị na soshal midia na-arụbu ya aka dịka ihe onyonyo fegharịrị na-egosi ebe onye yiri Nne regiina Daniel bụ Rita Daniels na-eti mkpu sị Chika ike hapụrụ nwa ya di ya. Mana dịka otu onye ihe ya na-amasị jụrụ ya ma ọ na-ayị Ned Nwoko, Chika Ike zara n'aka Instagram si na o nweghị sakramentị jịkọrọ ya na nwoke ahụ nke ọlụlụ ọ lụrụ Regina Daniel n'afọ gara aga wuru ewu na soshal midia. Ihe Chika Ike sara n'Instagram maka kepukpeu na ọ na-ayị di Regina Daniels bụ Ned Nwoko Cheta na abalị ole na ole gara aga na n ne Regina Daniel pụtara gọọ na ọ bụghị eziokwu ihe e kwuru na ya bụ ihe onyonyo ahụ fegharịrị ebe o kwuru nna ọ bụụ na Chika ahapụghị nwa ya na ya ga-agara ya ije na mụọ sị na ihe onyonyo ahụ bụ ""a rụrụ arụ."" Regina Daniels: Alụọla m di Regina Daniels atụnyere ndị ntị na-akọ ọkọ banyere ihe mere na ndụ ya nso nso azụ. Cheta na Regina onye na-ewu na soshal midia kemgbe ọnwa atọ kwere nkwa ịkụwa akịoyibo Nsugbe. N'ozi mgbaama dị n'ihe onyonyo o wepụtata na nsonso, ọ kpọrọ okwu aha kpomkwem sị n'ezie na kepukepu ahụ na-ewu banyere alụmdi ya bụ eziokwu. Regina Daniels Regina, onye aha Igbo ya bụ, Nneamaka, kwuru sị ""Alụọla m di"" dịka o wepụtara ọla aka dị ya n'aka tinye na mkpịsịaka nke so ọdụdụaka. Ọ gara n'ihu zaa ndị na-ekwu na ọ bụ maka ego mere o jiri lụọ onye tọrọ ya mgba n'elu, mgba n'ala sị, ""Obi na atọ m ka nnu ugbua n'ihi na ịhụnanay na-egbu m ka mmanya."" Ọ tụpụkwara egbe ntụnala dịka o kwuru na onye ikpeazụ o degara ozi n'ekwe ntị bụ Somadina. Cheta na dịka akụkọ na ọ lụụ onye ndọrọrọndọọ ọchịchị ama ama bụ Ned Nwoko na-ewu, akụkọ na ọ gbahapụrụ Somadina bụ onye ọtụtụ na-arụ aka na ọ bụ enyi ya nwoke wukwara. Akụkọ ga-amasị gị:" 47341638,https://www.bbc.com/igbo/47341638,Nigeria Election 2019: Nigeria ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala taa,Ndị Naịjirịa ga-aga n'ihu ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala n'ime afọ anọ ọzọ na-abịa.,"Cheta na e higharịrị ụbọchị ntuliaka onyeisiala site n'ụbọchị Febrụawarị 16, bufete ya taa bụ Febrụwarị 23. N'ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala, gụnyere ndị aha ha kacha ada ụda bụ Muhammadu Buhari dị afọ 76, Atiku Abubakar dị afọ 72, Kingsley Moghalu, Omoyele Sowore nakwa Fela Durotoye. Ebe Buhari bụ onyeisiala ugbua na-ekwu na o meela ka akụnaụba obodo mụbanye, ndị ọzọ na-azọ ọkwa ya na-ekwu na ọ naghị arụ ọrụ ọbụla. Onye ọbụla meriri na ntuliaka a kwesịrị ime ihe a hụrụ anya banyere enweghị ọkụ latrik, mpụ na nrụrụaka, ọnọdụ nchekwa obodo nakwa akụnaụba obodo. A ga-ebido ime ntuliaka mgbe ọ kụrụ elekere asatọ nke ụtụtụ a, ma mechie ya n'elekere abụọ nke ehihie. Mana onye ọbụla ka kwụ n'ahịrị mgbe e mechiri ntuliaka, ka ga-atụnwu vootu. Odobeghi anya ụbọchị a ga-akpọpụta mpụtara onye meriri; o nwere ike ịbụ ụbọchị mọnde maọbụ toozde maọbụ e mechaa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50002733,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002733,Kaduna kidnapping: Ndịagha azọpụtala ụmụakwụkwọ 6 atọrọ n'ụbọchị tụzde na Kaduna steeti,Ndị agha Naịjirịa anya na-acha ọkụ bụ ndị 'Operation Thunder Strike' azọpụtala ụmụakwụkwo atọrọ ma memila ndị ntọrọ tọrọ ha.,"Ụmụakwụkwọ a bụ ndị na-agụ na 'Government Day secondary school' Gwagwada nke dị n'okpuruọchịchị Chikun na-aga akwụkwo n'ụbọchị Tụzde mgbe ndị ntọrọ a tọrọ ha. Ndịagha a na-eme ngagharị nchekwa okporoụzọ mgbe ha nwetere ozi na ndi omekome na-awakpo ndi mmadụ n'okporoụzọ Abụja - Kaduna. Ndịagha egbughị oge dịka ha wakporo ndị ntọrọ a ma gbuo otu n'ime ha ebe ndi ọzo jị ọnya mgbọ egbe gbaba n'ime ọhia. Etu a ga ha siri were zọpụta ụmụ akwụkwo isii ndia nille ma naputa ndi omekome a otu egbe 'AK-47', mgbo egbe pụrụiche asaa nke ""7.62mm"" na egbe 'Pump action' na mgbọ iri so ya. Egbe a natara ndị omekome na Kadụna Steeti. Ndiagha a gara n'ihu chebiri ndị ntọro a na Soho Gaya nke dị na okpuru ọchichị Chikun n'ihe dịka elekere nke iri n'ụtụtụ. Nchebiri ndiagha mụtara mkpụru dika ha gburu otu onye omekaome a ma natakwa ha otu egbe rifụl, gbụo ndị omekaome abụọ ma natakwa ha egbe AK 47 abụọ, otu egbe 'Pump action' na mkpo mgbo egbe atọ. Meria kpalịri mụọ ndịagha, ebe onyeisi ndịagha nke 'Commanding Division 1' bụ Major General Faruk Yahaya toro ha ma gbaa ha ume ka ha jisie ike memilaa ndị omekome niile no na mpaghara ahụ. Dịka ọ dị ụgbụa, ndịagha Naịjirịa ka na-achọ ndị ntọ na ndị omekaome n'ime ọhia nke dị na mpaghara ebe ha wakporo ndị ntọrị a. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ" 45186257,https://www.bbc.com/igbo/45186257,Ụmụ Igbo nọ Ghana: Gọọmentị Ghana na-akpagbu anyị,Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-azụ ahịa ebe ahụ gwara BBC Igbo na ụmụafọ Naịjiria na ndị ogbo ha n'obodo ahụ enweela nkwekọrịta na udo ga-achị.,"Maazi Obiora kwuru na nke a mere maka esemokwu dara n'etiti ndị Naịjirịa na ndị Ghana. Ndị ọchịchị Ghana e nyela iwu maka etu ndị Igbo na-ere ahịa ga-esi na-ere ahịa n'obodo ha. Ọ si na nsogbu a bidoro ka gọọmenti Ghana wetara atụmatụ na ndị Naịjirịa na ndị mba ọzọ kwesịrị inwe ihe Bekee kpọrọ ""equity"" ruru nde dọla. Onye wepụtara atụmatụ a bụ minista na-ahụ maka azụmahịa. Obiora kwuru na agbanyeghị na atụmatụ abụghị ihe ọhụrụ, maka na gọọmenti rituru n'ọchịchị chọrọ ime ya, ozighi ezi ugbua etu ozighi ezi mgbe ahụ. Ndị ahịa akụrụngwa na-esikarị mba ofesi enweta ngwaọrụ ha N'agbanyeghị na ahịa ga-emepe echi, Obiora sị na ọ bụ nkata gọọmenti Naijiria na nke Ghana kpara mere ha jiri gbanyụọ ọkụ. Ma kwukwa na ha si ụzọ ọzọ bata. Nyocha ndị na-enweghị ""equity"" nke ga-amalite echi. Anyị kara ime karịa nke a ma ọ bụrụ na ndị gọọmenti nye anyị aka Otu onye sị na ihe a ga-emetụta ya bụ Nwafor Akajiofor, bụ onye na-azụ ahịa n'Ahịa Magazine. Akajiofor kwuru na okwu 'resident permit na equity' bụ atụmatụ gọọmenti Ghana ji chọọ ịchụpụ ụmụ Naijiria na Ghana. O kwuru na akwụkwọ na-enye ikike ibi na Ghana bụ 'resident permit' abụghị ihe dị mfe inweta. Ihe ndi na-amụ ọrụ kwesịrị ịma ""Resident permit ahụ na-ericha 200,000, mana inweta ya abụghị ebe o biri."" Obiora na onwe ya sị na ihe na-agba anyammiri bụ na iwu Ghana hibere bụ na ndị mba ọzọ agaghị azụ ahịa n'ime ahịa. ""Ndị nwere akwụkwọ zuru ezu agaghị aganwu n'ime ahịa zụọ ahịa, ọ bụ naanị n'okporoụzọ ka ha ga-enwe ụlọahịa, dịka iwu a siri kwuo."" Dịka o si kwuo, ọ bụrụ na ndị Ghana gaa n'ihu sobe iwu a, ọtụtụ ụmụafọ na mba ahụ ga-ala makana ha agaghị emenwu ihe dị na ya." afirika-55790865,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55790865,Chief of Army staff: Etu Major General Attahiru Ibrahim si nọchie Buratai chụrụ ya n'afọ 2017,Ị ma na Ibrahim Attahiru bụ onyeisi ndịagha Naịjiria a ka nyere ọkwa a nọchiri onye chụrụ ya n'afọ 2017?,"Tukur Buratai bụ onyeisi ndịagha nke pụrụ apụ, wepụrụ Attahiru n'ọkwa dịka onye ndu ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha n'ọnwa Disemba 2017. N'agbanyeghi na ha ekwughi ihe mere e ji wepụ Attahiru n'ọkwa mgbe ahụ, mwepụ ya butere ọtụtụ mwakpo ndị mmadụ n'aka ndị Boko Haram, nke gụnyere ogbugbu ihe ruru mmadụ 50 n'ime otu ụlọalakụba n'ọnwa Nọvemba nke afọ ahụ. Mara na nke a bịara ka ụbọchị 40 Buratai nyere ya iji hụ na ọ nwụchiri Abubakar Shekau bụ onyeisi Boko Haram n'ọnwụ maọbụ ndụ, gachara n'ọnwa Julaị 2017 ahụ. Kama inwụchi Shekau n'ọnwa ahụ, ihe ruru mmadụ 40 nwụrụ n'ime otu ọgụ ndịagha gara ịzọpụta ndị mmadụ ndị omekome a wakporo n'ọtụtụ ụgbọala na-agakọ ọnụ. Ndị nwụrụ na mwakpo ahụ gụnyere ndị uweojii na ụfọdụ ndị ụlọọrụ na-achọpụta mmanụ agbịdị. Attahiru nọbu n'isi ndị du agha ibibi Boko Haram ebe ha na-akpa mkpamkpa na mpaghara Nọt-Ist n'ọnwa Mee n'afọ ahụ. E mechara were General Nicholas Rogers du ndị agha pụrụ iche na ụfọdụ ndị uweojii ịkwụsị ọgụ dị n'etiti agbụrụ na mpaghara ahụ, tichie Attahiru. Ihe ndị ị kwesiri ịma maka ndị isi nchekwa ọhụrụ Naịjiria Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka onyeisiala Naịjirịa bu Muhammadu Buhari gbanwere ndị isi nchekwa. O kwuputara n'akara Twitter ya na ọ nabatara akwụkwọ nkwụsị ọrụ ha ma kelee ha maka aja niile ha chụụrụ ndị Naịjirịa n'ọrụ ha. N'otu aka ahụ, o wepụtakwara aha ndị ga-anọchi anya ndị na-apụpụ n'ọrụ nchekwa obodo. Nke a na-abịa adịka ndị mmadụ na-akatọ ndị agha maka omume ha n'Orlu, Imo steeti. Aha ndị ọhụrụ na-abata bụ: Ọchịagha I Attahiru bụzi onye ji ọkwa 'Chief of Army Staff' Ọchịagha I Attahiru Nọchiri anya Tukur Buratai dịka 'Chief of Army Staff' Attahiru jiri ọkwa dị iche iche n'otu ndị agha Naịjirịa. Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno State, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'. Ọ bụ oge Attahiru na-achịkọta ngalaba a ka Boko Haram kpara ọtụtụ mkpamkpa ha kpara n'afọ 2017. Otu n'ime ha bụ oge ndị Boko Haram wakporo ndị ụlọọrụ NNPC gara njem ịchọpụta mmanụ agbịdị na mpaghara 'Lake Chad'. Ndị agha iri na abụọ tufuru ndụ ha na mwakpo ahụ, ebe ndị Boko Hara tọọrọ ụfọdụ ndị nkuzi Mahadum 'University of Maiduguri' so wee mee njem ahụ. N'ọnwa Disemba afọ 2017, e wepuru Attahiru dịka onyeisi 'Operation Lafiya Dole' ma zighachi ya n'isi ụlọọrụ ndị agha dị n'Abuja. Ọchịagha Leo Irabor nọchiri anya Gabriel Olonisakin dịka 'Chief of Defence Staff' Ọchịagha Leo Irabor Nọchiri anya Gabriel Olonisakin dịka Chief of Defence Staff. Irabor rụkwara ọrụ ọtụtụ afọ dịka onyeisi operation lafiya dole. Ọ bụ Irabor hafere ọchịchị ngalaba ahụ n'aka Attahiru n'ọnwa May afọ 2017. Irabor mechara rụọ ọrụ dịka onyeisi ngalaba ndị agha na-ahụ maka ọzụzụ nke a kpọrọ 'training and operations' na bekee. Ọchịagha mmiri A.Z. Gambo Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba mgbasaozi nke ndị agha mmiri Naịjirịa Ọ nọchiri anya Ibok Ete-Ibas dịka onye isi ndị agha mmiri. Ọ bụ n'afọ 2016 ka e si n'ọkwa Commodore bulie Gambo n'ọkwa Rear Admiral. I.O Amao nọchiri anya Sadique Abubakar Ọchịagha Isiaka Oladayo Amao Ọ bụ onye nọchiri anya Sadique Abubakar dịka onyeisi ndịagha ụgbọelu Naịjirịa. Ọ banyere n'otu ndịagha n'afọ 1984, ma jikwaa ọkwa dị icheiche n'isi ụlọọrụ ndị agha ụgbọelu dị n'Abuja." 47758307,https://www.bbc.com/igbo/47758307,"Aka akparala ụkọchukwu,otu nwaanyị maka imetọọ ụmụaka","Aka ndị uweojii akparala otu ụkọchukwu a kpọrọ Ezuma Chizemdere nke ụka 'Jesus Intervention Household Ministry' Ejigbo,Legọs maka imetọọ ụmụaka ụmụnwoke atọ ma nye ha ọrịa mmịnwụ (HIV.)","Oge a nwụchiri ya, Chizemdere, onye gbaburu ọsọ ka ọ chọpụtara na ndị uweojii na-esi imi n'ala iji nwụchi ya kwuru na ya na-enye ụmụaka ụmụnwoke ndị ahụ puku naira abụọ oge ọbụla o dinara ha. Ndị agbataobi gbara ama na ha na-ahụkarị ụkọchukwu ahụ kwa ụbọ cchị ka ọ na-asụ akwa akwa ndina rụrụ isii kwa ụbọchị ma ọ kpọbatacha ụmụaka. N'aka nke ọzọ, a kpụrụ otu nwaanyị dị afọ iri atọ na asaa, akpọrọ Veronica Vincent n'ụlọikpe na Legọs maka ịmetọ nwa nwaanyị dị afọ abụọ n'Idimu dị na Legọs. Nne mụrụ nwata ahụ na-ekwu na ọhụghị nwa ya were chọọ ya banye n'ọnụmara agbataobi ya bụ Veronica ebe ọ hụụ nwata hụ ma hụwa na ọgọdọ ukwu ya nwere ka ọ dị. Mgbe nwaanyị ahụ lere ahụ nwa ya ọ hụrụ na mmiri abanyela opi ụgbọgụrụ. Akụkọ ga-amasị gị: O wegara ndị uweojii ozi ndị kpụrụ nwaanyị ahụ eboro ebubo ụlọikpe." afirika-45003090,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45003090,Lee ihe idemmiri na-eme n'ala Igbo ugbua,"Udu mmiri abịala ọzọ, ihe a ebutela nnukwu idemmiri na ọtụtụ ebe di icheiche mana akụkọ ugbua gosiri na ọtụtụ ebe n'ala Igbo emeghị njikere nke ọma maka udu mmiri a.","Okporo ụzọ MCC, Urata n'ime Owere Cheta n'ime izuụka gara aga ndị ụlọọrụ National Emergency Management Agency' (NEMA) na Bekee kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo ndị dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa. Ide mmiri na-emekwa n'Ebonyi nakwa ụfọdụ steeti ndị ọzọ na Naịjirịa Mana ka o si-aga ugbua, ide mmiri na-asizi ndị mmadụ 'kwapu-kwapụ' n'ọtụtụ ebe n'ala Igbo. N'ime akụkọ a, anyị ga-egosi foto di icheiche gosi ebe ide mmiri mebiri ọtụtụ okporo ụzọ n'ala Igbo. Owere Stephen Mbonu zitere anyi foto nke a gosi ide mmiri na-eru n'okporo ụzọ MCC Road, Urata n'ime Owerre n'Imo steeti mana ọ kọwara na mmiri a na-agbada agbada na ngwụcha ole na ole. Udu mmiri na-ebute nnukwu ide mmiri afọ niile n'ala Igbo Foto ndị a, nwanyị aha ya bụ DebbyEloo Ifejiofor Ezeamama setera bụ nke kachasị njọ. Okporo ụzọ a, dị na mgbemena n'Awada, Onitisha n'ime Anambra steeti. Okporo ụzọ a kewara maka mmiri ji ụbọchị ole na ole zoo. NIMET ka na-adọ aka na ntị na oke mmiri a ezochabeghị. Ọtụtụ mmadụ akwapugo n'ebe ide mmiri mebiri ụzọ. Nke a bụ ozi Pharez Okpere dere gosi ebe ide mmiri mebiri ụzọ na Benin n'ime Edo steeti. Otu nwoke aha ya bụ Nnamdi Ojiego kowara BBC na Ide mmiri emebiela okporo ụzọ Ọlụ-Ideatọ-Ụga kamgba afọ iri na ise garaaga. O kwukwara na obodo dịka Obioha na Umuchima bụ ebe ọ kachasị dị njo na mpaghara ebe a. N'ọnụ okwu ya: ""Ọ bu gọọmenti ka ikpe mara na nsogbu a. N'obodo dịka Akowa na Umuchima, ọ bụ gọọmenti kwariri ụzọ a iji rụọ ya, mana ruo ugbua, onweghị ọrụ ọbụla metutara okpọrọuzo ndị a"" Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48957619,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48957619,Ivory Coast vs Algeria: Algeria na Nigeria ga-agba egwu onye ike ga-agwụ,"Ka ọ dị ugbua, Ọljiria na Naịjirịa ga-alụ ọgụ isi ekwe ọnwụ mgbe otu abụọ a ga-ezute n'ọkara-ikpeazụ nke Africa Cup of Nations (AFCON).","Ọljiria ji goolu anọ ha nyere na penariti ji merie Aịvọrị kost nyere naanị atọ n'ime ise ise ha gbara. N'ime nkeji iri itoolu e ji gbaa bọọlụ, otu abụọ a gbara bọọlụ ka ndị ji ibe ha ụgwọ akwụcha akwụcha. Nke mere ka Sofiane Feghouli nke Ọljiria buru ụzọ nye goolu na nkeji 20. Baghdad Bounedjah mechara goolu ọzọ na nkeji 48 mana a gụfuru ya agufu. N'ọkara nke abụọ, Jonathan Kodjia gbaara Aịvọrị kost aka ahịa na nkeji 62. Egwu a kpọrọ akpọ Na ha nyere goolu abụọ a egboghi ọgụ a, makana ha mechara gbaa nkeji iri atọ ọzọ nke Bekee kpọrọ ""extra time"", iji zọọ isi onwe ha. Ka isi apụtaghị, ọ banyere na ""gbaa ka anyị laa"", bụ penariti, ebe mba abụọ a zọrọ isi onwe ha. Etu e si gbaa penariti AỊVỌRỊ KOST ỌLJIRIA Franck Kessie - nyere Ramy Bensebaini - nyere Maxwel Cornet - nyere Islam Slimani - nyere Wilfried Bony - riri Andy Delort - nyere Max-Alain Gradel - nyere Adam Ounas - nyere Geoffroy Serey Die - riri Mohamed Youcef Belaili - riri Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ" afirika-46779420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46779420,Gabon Coup attempt: E gburu ndị agha abụọ soro nara ọchịchị n'ike,Akụkọ si Gabon na-akọwa na ndịagha chọrọ ịnara ọchịchị n'ike na Gabon nọzị n'aka ndị nchekwa.,"The Gabonese president is being treated in Saudi Arabia Gọọmentị Gabon kwuru na ha ji mmadụ anọ aka ha dị n'ihe a. Ndị wakporo ụlọ ntaakụkọ gọọmenti ma zipụ ozi ka ndị mmadụ banye kpọkuba ka achụtuo Onyeisiala Ali Bongo. Ha sị na ha mere nke a iji weghachite ọchịchi onye kwuo uche ya. Ali Bongo bidoro ịchị mba ahụ n'afọ 2009. Ezinaụlọ Bongo achịala Gabon ihe ruru afo 50. Bongo dara ọrịa nkpọnwụahụ bụ ""stroke"" na Bekee n'ọnwa Ọktọba nke afọ 2018, ma nọọrọ mba Moroko ugbua na-anata ọgwụgwọ. Agbanyeghị na o zipụrụ ihe nkiri iji gosi na ọ na ha agbake n'ute ọrịa n'ọnwa Jenụwarị, ndị agha a sị na ọ dabaghị, ma kwuo na ọ bụ 'usoro ọ chọrọ iji nọdụ n'ọkwa onyeisiala. Ndị agha a kwuru uche ha na ihe onyonyo pụtara na soshal midia. Firmain Eric Mbadinga nke BBC Afrique sị na nara ọchịchị n'ike a ndịagha mere dara ndị mmadụ n'ebube. Na nkọwa ya, ọchịchi Bongo yiri ihe kwụ chịm, ọkachasị mgbe ozi afọ ọhụru ya pụtara. O kwukwara na ndịagha Gabon na-akwado ezinaụlọ Bongo ọfụma, makana ọ bụ ndị nche onyeisiala, bu ndi ọtụtụ n'ime ha si mpaghara obodo Bongo ha. Akuko ka na-ekwu na ọgbaghara ka na-ada na Libreville. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51210425,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51210425,Lassa Fever outbreak: Ịba Lassa egbuola onye nke abụọ n'Enugwu,Iba Lassa egbuola onye nke abụọ nke ọrịa ahụ jidere Enugwu steeti.,"Nwata nwaanyị ahụ gbara afọ 24 nwụrụ n' ụlọgwụ 'UNTH' Enugwu. 'Permanent Secretary' Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike n'Enugwu steeti bụ Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi gwara onye ntakụkọ anyị bụ Ebere Ekeọpara na nwaanyị ahụ gbara afọ 24 nwụrụ ka o mechara awa ole ma ole ebutere ya n'UNTH Ituku Ozalla. O kwukwara na e liela ozu nwaanyị ahụ n'obodo ya tata bụ Fraide. N'otu aka ahụ, onyeisi ụlọọgwụ UNTH bụ Dọkịta Obinna Onodugo kwuru na amalitela ịchọ ndị ya na nwaanyị ahụ nwụrụ metụkọtara iji gbochie ya bụ ọrịa ifesa n'etiti ndị ọrụ ụlọọgwụ ha nakwa ụlọozu. Onodugo gbara ama na ha nwere ọgwụ maka ndị o metụtara ma dụọ ndọ ọrịke ka ha kee nckwụcha igbochie inweta ọrịa ahụ site na nkwado kwesịrị. Nke a mere ya mmadụ atọ butelera ọrịa Lassa n'Enugwu. Mmadụ abụọ n'ime ha anwụọla, ebe onye nke atọ nọzị n' ụlọ ọgwụ Lassa dị n'Abakaliki ebe ọ na- anara ọgwụgwọ. Otu onye ọzọ eburula ọrịa Lassa Fever n'Enugwu Ndị ọrụ ụlọgwụ Parklan Hospital dị na GRA, Engwu Nwagbọghọ gbara afọ 23 abụrụla onye nke abụọ buterela ọrịa Lassa Fever n'Enugwu steeti. Odeakwụkwọ mịnịstrị ahụike na steeti ahụ bụ Ifeanyi Agujiobi gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nke n'Enugwu. Lassa Fever Outbreak:Etu e si lie nwaanyị Lassa Fever gburu Ọ kọwara na nwagbọghọ ahụ bụ onye nkuzi Nsukka malitere rịawa ọrịa, nke ndị ụlọọgwụ ji mịrị ọbara ya ga mee nyocha n'Abakaliki. Nyocha e mere gosiri na ọ bụ ọria lassa fever na-arịa nwa agbọghọ ahụ. Agujiobi sị na e burula ya gawa n'ụlọọgwụ lassa fever dị n'Abakaliki, Ebonyi Steeti, ebe ọ nọ na anara ọgwụ ugbua. N'ịza ajụjụ ọnọdụ ndị ọrụ ahụike ahụ metụrụ Christiana Ugwuoko nwụrụ n'ọrịa a ahụ, Agujuobi kwuru na ọ bụ ndị ọrụ ahụike Park lane Enugwu mmadụ 174 ka a na enyocha ugbua. O kwuru na onweghi onye ọrụ ahụike nwere ọrịa a mana e nyere ụfọdụ n'ime ha a kpọrọ 'Category 3' ụbọchị 21 ka ha ga zuo ike, ka e were lee ma ọrịa ọ ga ebido ha. Iji chekwaba ndụ ndị mmadụ wee hụ na ya bụ ọrịa ogbugbu agbasaghị Gọọmenti Enugwu ewerela aka ha lie ozu nwaanyị nwụrụ n'ọrịa Lassa n'Enugu. E liri ahụ nwaanyị ahụ na be ya bụ Amọji Nike, Enugwu. Gọọmenti agaala n'ihu inyocha ndị ezi na ụlọ nwaanyị ahụ iji mata ma onwere onye bu ọrịa ahụ. Perm Sec Mịnịstrị ahụike bụ Dr Ifeanyi Agujiobi kwuru nke a n'Enugwu. Dịka nke a na-eme, egwu ji ndị ọrụ ụlọgwụ ahụ dịka ha na-atụ nje n'ụfọdụ ha nwere ike inweta nje ọrịa ahụ dịka nwaanyị ahụ nwụụ nọrọ ihe karịrị otu izụka tupu amata ihe na-eme ya. Ọrịa Lassa abaala Enugwu steeti Akụkọ pụtara ụbọchị Wenezde kwuru na otu onye nwụrụ maka Ịba Lassa n'Enugwu. Onye ntaakụkọ BBC gara n'ụlọgwu Parklane dị na GRA, Enugwu ụbọchị Wenezde kwuru na ụlọọgwụ ahụ nọ na katakata ugbua dịka ọrịa 'Lassa fever' gburu otu nwaanyi achọghị ịkpọ aha ya. O kwuru na ndịọrụ ahụike ka nọ na mgbagharị ebe ndị ọrụ nchekwa na-agba ọgwụ n'ụgbọala niile dị n'ogige ụlọọgwụ ahụ nakwa na gburugburu ya. Otu Dokita na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọwaara BBC na ya bụ nwaanyị bụ Christiana Ugwuoko gbara afọ iri asaa na ise bụ onye Amọji Nike dị n'Enugwu steeti. Dọkita ahụ gwara anyị na ya bụ nwaanyị anọọla ihe dịka otu izu ụka na ngalaba gbatagbata (emergency ward) nke ụlọọgwụ ahụ tupu ebubata ya na ICU. Ọbụzị na ICU ahụ ka ha bidoro nyowe ihe na eme ya bụ nwaanyị enyo. Ndị na-efe ọgwụ mgbochi nje Ha wee mịrị ọbara ya ziga n'Abakaliki ebe a na enyocha Lassa fever nke ọma, tupu ya bụ nyocha Lab alọta, ya bụ nwaanyị anwụọla. Onye ntakụkọ anyị gbakwara ama na e jichiela ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike metụrụ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ahụ maka nnyocha nakwa ịhụ na ọrịa ahụ efesaghị. Dịka onye isi mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịta Ifeanyị Agụjiobi si kwuo, e zigarala ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC ozi maka ya bụ ihe dapụtara. Ọ gara n'ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri ncha na-akwọ aka ha oge ọbụla, gbara ịṄụ gari nakwa iri oke ọsọ. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42807376,https://www.bbc.com/igbo/42807376,Tanka bu mmanụ ụgbọ-ala agbaala ọkụ n' Ojo,"Onyeisi ndị na-emenyu ọkụ na, Legọọsi steeti bụ Rasak Fadipe ekwuola na onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ ahụ gbara n'ehihie ụbọchị 24 Jenuwarị, 2018.","Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos Ọkụ tanka bu mmanụ ruru puku iri atọ na atọ n'ime ya, gbaara ọkụ n'Ojo, Lagos Steeti. Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-agbaọsọ ndụ n'ebe ahụ. Rasak Fadipe gwara ndị ntaakụkọ na ""Ozugbo m nụrụ maka ọkụ a ka m kpọrọ ndị na-emenyụ ọkụ dị n'Ọjọ, ha gbatakwara ebe ọkụ a na-ere."" ""Mana mgbe anyị ruru ebe a ka anyị hụrụ na ọ bụ mmanụ ụgbọala na-agba ọkụ. Ọ bụ mgbe ahụ m kpọkọtara ụlọọrụ ndị ọzọ na-emenyụ ọkụ ozugbo ozugbo."" Okwu mmanu ugbọala gbara n'uzọ ana-agbakarị ""Ndiuweojii na ndị agha mmiri nyere ndị Lagos State Emergency Management Agency (NEMA) enyemaka ịmenyụ ọkụ ahụ n'elekere atọ na nkeji iri atọ nke ehihe"" Olayinka Ajaba bụ onye nnọchịanya NEMA kwuru na nsogbu nke a sị n'oge ha jị aka na-amịpụta mmanụ ụgbọ ala . Onye isi ndịuweojii n'Ijegun bụ SP Audu Ibrahim, gwara ndị ntaakụkọ na ha gbaara mbọ hụ na udo di mgbe ya bụ ọkwụ na-agba. Ugbua, ndi obibi Ijegun Ibasa ekwuola na ha chọrọ ka gọọmentị Lagos steetị guzobe ulọ mmenyụ ọkwụ n'akụkụ ebe ahụ dika NAN sịrị kọọ." afirika-50470495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50470495,Queens College: Nwata akwụkwọ kwanyere mbọ na nkuanya etekarala nsị,Ihe onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia gosiri ebe nne nwaanyị na-abaso onye nche Queens College ọgụ maka etu ha si chụghachị nwa ya nwaanyị azụ.,"Ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n'ụlọakwụkwo a n'afọ 2017 oge nje banyere na mmiri ha N'ime onyonyo ahụ, ndị nche ahụ na-ekwu na ha chụghachiri nwa ahụ azụ makana ọ kwanyere mbọ na nkuanya wee bata n'ụlọakwụkwọ. Kamgbe ihe ahụ mechara, ndị mmadụ bidoro kwukwe na soshal midia obi ha gbasara ihe nwata akwụkwọ ahụ nakwa nne ya mere. Lee ụfọdụ ihe ndị ha kwuru. Ede Akao kwuru na ihe nne nwata akwụkwọ nwaanyị ahụ mere dị mma izunye ya mmanya juru oyi. @CNebonta kwuru na ọ kwadoghi ụmụakwụkwọ ikwanye nku anya gawa ụlọakwụkwọ, mana etu esi adọ nwata ahụ aka adaịghị mma. @HormoB kwuru na ụta diri nne nwa ahụ ma dịkwara ụlọakwụkwọ Queens college. Mana @ebelee_ kwuru na nwaanyị ahụ bịara ịchekwa ya makana e nwereike itigbu ya. @Darablaqie kwuru na-ekwesiri inye nwata akwụkwọ ahụ ohere ka o hịchapụ ihe niile ahụ ọ kwanyere karịa ma ịchụpụ ya. Ihe ụlọakwụkwọ ahụ kwuru maka ihe a merenu Akụkọ ka na-abịa dịka anyị na-agba mbọ ịnụta onu ndị isi ụlọakwụkwọ Queens college. Akụkọ ndị ga-amasị gị Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara" afirika-49131209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49131209,Marriage Certificate: Asambodo agbamakwụkwọ gị ọ bụ adịgboroja?,Asambodo i ji gbaa akwụkwọ ọ bụ nke ezigbo ka ọ bụ nke adịgboroja?,"Ka ị na-eche nke a, Georgina Ehuriah na-arụ na Mịnịstrị na-ahụ maka Naịjirịa niile gwara BBC na ọ bụ naanị ụlọekpere 314 nwere ikike ịgba ndị mmadụ akwụkwọ ma nyekwa asambodo agbamakwụkwọ dị mma. Ehuriah kwuru na ọ bụrụ na i si ebe enweghi akwụkwọ ikike nke a kpọrọ ""license"" nweta asambodo agbamakwụkwọ gị, na ị nwere ike ịdaba na nsogbu mgbe oge ruru iketa oke ma di maọbụ nwunye gị nwụọ. Ọ gwara BBC Pidgin sị ""Ụdịrị ihe a na-eme oge ọbụla, ebe ị ga-ahụ di na nwunye chọrọ ịga obodo oyibo, ""embassy"" agaghị eji asambodo ụlọụka ndị enweghi akwụkwọ ikike nyere gị kpọrọ ihe, makana naanị asambodo Naịjirịa na-enye maka agbamakwụkwọ bụ nke a kpọrọ ""Form E"". ""Nke a mere ndị ma ihe na-eji aga n'ụlọikpe agbamakwụkwọ bụ ""Federal Marriage Registry"" gaa gbaa akwụkwọ tupu ha agbaa nke ụlọụka, makana ofufe bụ ihe ndị Naịjirịa jiri biri. Ehuriah na-arụ ọrụ dịka odeakwụkwọ pụrụiche na mịnịstrị ahụ kwuru sị na ị nwere ike ịga na websaịtị mịnịstrị ha ịchọpụta ma ụlọụka gị enwekwara akwụkwọ ikike. O kwukwara na ị ga-aganwu na websaịtị ahụ tinye akwụkwọ maka inweta asambodo agbamakwụkwọ. Mwakpo ndị Uweojii Saụt Afrịka wakporo onye Naịjiria Gọọmentị Naịjirịa edegarala ndị uweojii Saụt Afrịka akwụkwọ maka mwakpo a wakporo Tayo Faniran n'izu a. Tayo na onwe ya mechara kelee gọọmentị Naịjirịa maka ịgbatara ya ọsọ enyemaka. Cheta na Tayo nọchiburu anya Naịjirịa na Big Brother Africa wepụtara ihe nkiri gosiri oge ndị uweojii mba ahụ tiri ya ihe ma tọdo ya n'olu. Na mba ofesi, Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị itoolu dị ime so na ndị azọpụtara Azọpụtala ihe karịrị mmadụ narị asaa tọrọ n'ime ụgbọoloko kemgbe abalị Fraịde n'obodo Mumbai dị na mba India. Oke mmiri ozuzo butere idemmiri mere ka osimiri tojuo ma na-awufu awufu. A hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya. Henry Onyekuru na-agbara Super Eagles nke Naịjirịa bọolụ gbara nkwụ nwaanyị ya taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Julaị na Bini, Edo steeti. Henry na Esther enyi ya nwaanyị amụọla otu nwa nwoke dị otu afọ na ọma. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ihe ụmụnwaanyị na-ekwu maka 'Senate screening'" egwuregwu-49789304,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49789304,West Ham vs Man United: E tiela Man United ka ịgba udubọnch,Ihe na-ebe ka na-ebe n'ụlọ ndị Manchester United nọ dịka West Ham United ji ọkpụ goolu abụọ merie ha n'asọmpi Premier League.,"West Ham kpọbatara Man United n' ụlọ ma were ọkpụ goolu abụọ asataghị otu kụọ ha ihe okenye kụrụ nwata dịka ụmụaka. Nke a malitere mgbe Andriy Yarmolenko nke West Ham ji goolu mba maa Man United aka ntị na nkeji 14. Man United siri ọnwụ dịka nkịta a na-achọ igbu mana West Ham kelara aka n'azụ. Nke a megidere ruo n'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a mana Onweghi onye nyere ibe ya goolu ọzọ. N'ime nkeji 84 ka ọ fọrọ nkeji isii ka e gbuchie bọọlụ, West ham nyere goolu nke abụọ site n'aka Aaron Cresswell. Site na mmeri a, West Ham United bụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ ebe Man United bụ ndị asaa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51153241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51153241,Peruzzi: Ihe mere na ị gaghị echefu izuụka a ọsịsọ,Izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi na ọtụtụ ihe mere n'ime ya abụghị ihe ị ga-echefu ọsịsọ.,"Ka anyị bido na nke metutara ndị ọchịchị. Ihedioha tetara ura dịka Gọvanọ ma labaa ka . . . Ụlọikpe kachasị kpebiri ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Imo Steeti. Ha kwuru ka e were ọso were ije chụpụ Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo steeti ma tinye Hope Uzọdịnma. Ihe mere ka ikpe a pụọ iche bụ na ụkọchukwu katọlik 'Father Mbaka' buru amụmu wee kwuo na 'Hope' na-abịa n'Imo steeti. Mana ka nke ahụ mechara, Emeka Ihedioha, rịọrọ ndị Imo ka ha kwado ọchịchị Uzodinma. Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede Wenezde. Asịrị maka ọnwụ Bobrisky Akụkọ asị na Bobrisky anwụọla wuru ewu Okuneye Idris onye e ji Bobrisky mara wuru ewu n'izuụka a dịka akụko na ọ nwụru na ihe mberede okporo ụzu bidoro wuwe. Kama Idris gara na 'Instagram' ya wee bụọ ndị niile buru akụkụ asị ahụ ọnụ. Davido na Peruzzi Oti egwu Perruzi Onye mmepụta egwu aha ya bụ King Patrick ebola oti egwu bụ Peruzzi ebubo na omezughị nkwekọrịta ha nwere mgbe ọ weere ya dịka onye oti egwu n'ụlọọrụ ya bụ 'Golden Boy Entertainment'. Patrick kwuru na ọ were Peruzzi n'ọrụ dịka oti egwu, nye ya ụlọ obibi ma meere ya ihe onyonyo atọ na ihe ndị ọzọ. Ọ kọwara na Peruzzi hapụrụ nkwekọrịta ha ma gaa tinye aka na akwụkwọ n'ụlọọrụ 'DMW' nke oti egwu Davido bụ onyeisi ha. Nke mere ka a kpụrụ mmadu ato a n'onu n'ịzụuka a. Dịka ọ dị ugbua, Patrick si na ikpe ha dị n'ụlo ikpe. Ncheta agha Biafra Odumegwu Ojukwu bụ Onyeisi Biafra oge agha. ""Ọzọ emena"" bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu dịka e mere emume ncheta afọ iri ise agha Biafra biri n'ụbọchi iri na ise nke ọnwa Jenuarị 2020. 'Anyị chere na anyị bịara ịnabata ndị enyi, anyị amaghị na ọ bụ ọnwụ anyị ka anyị na-agakwu' Ọtụtụ akụkọ ihe mere oge ahu butere ọtụtụ akwa arịri na mwute. Anyi ka na-asị kwa 'Ozọ Emela'. Gaa gụọ ya n'uju ebe a. Ọnwụ Rocky Johnson nna Dwayne Johnson ""The Rock"" Nna ya nwụru anwụ bụ Rocky Johnson kuziri Dwayne Johnson etu esi agba mgba Dwayne Johnson 'The Rock' onye e ji ịgba mgba na ime ihe onyonyo mara na-eru uju maka ọnwụ nna ya bụ Rocky Johnson. Rocky Johnson bụ onye mgba a ma ama n'oge gboo, ma bụrụ kwa oneyisiojii mbụ tuuru ugo dịka 'Tag-Team Champion' ya na 'Tony Atlas. A mụrụ ya n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgụst n'afọ 1944. Nwoke kpụrụisi na-aruzi igwe ọkụ (Generator) Lee ka Emeka Abugu si arụziri ndị mmadụ ụgbọala, ọgba tụmtum, igwe na-enye ọkụ latrik nakwa taya mebiri emebi na-agbanyeghị na o kpuru isi. Blind Mechanic: Lee nwoke kpuru isi na-arụ 'Mechanic' Barack Obama na nwunye ya Mitchel Obama Onye chịbụru dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Baraka Obama zitere nwunye ya ozi ekele maka ụbọchi ncheta ọmụmu ya. Akụkọ ga-amasị gị ịkọ" afirika-43207886,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43207886,Joe Achuzia: Ihe ị na-amaghị maka 'dike Biafra',Joe Achuzia bụ onye ndi Igbo na-ahụ ka dike n'agha maka ike ọ kpara n'agha Biafra. Ụnyaahụ ka Achuzia lara mmụọ n'afọ 90.,"Achuzia bụ onye Asaba a ma ka onye na adịghị atu egwu, a makwa ya maka etu o siri duo ndị agha Biafra na nchekwa ọnicha n'oge agha. N'agbanyeghị na Achuzia sepụrụ aka ka onye agha, ọ tinyere ọnụ n'ihe gbasara Biafra. Na nkata ya na ndị ọrụ ntaakụkọ Sun nwere n'ọnwa May 2016, Achuzia sị n'onwere mgbe ha bụ ndị Biafra chiliri aka elu, maka ya bụrụ na ya chinyiri aka elu ọ ga-enwe akwụkwọ edere banyere ihe a. ""Ke ebe akwụkwọ ha dị,"" Achuzia jụrụ ndị ntaakụkọ Sun. Lee ụfọdụ ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka Joe Achuzia: BBC Igbo gbara otu onye lụrụ agha Biafra bụ Mejọ Foster Mbaekwe, ajụjụ ọnụ, o kwuru sị na ọ lụghị ọgụ n'okpuru Achuzia, kama na Achuzia bụ kọmanda siri ezigbo ike, onye a na-akwanyere ugwu ọfụma ma bụrụkwa onye rụpụtara ihe a hụrụ anya. Ihe Okey Ndibe kwuru maka Biafra Mbaekwe kwuru n'otu njirimara ndị mmadụ ji echeta Achuzia gbasara agha Biafra bụ mkpamkpa ọ kpara ịgba ụgbọala ndị agha Naịjirịa ọkụ n'Abagana, bụ 'ihe atụghịanya' n'ọbụghị ike aka Achuzia ka-esi chere. ""Otu nkem bụ 7th battalion, anyị cheere ha na Nkpor tupu ihe ahụ emee n'Abagana, ya mere onye ọbụla ebunyela ya ebube ahụ."" ""Ya na ụfọdụ ndị isi ndị agha esighị otu ụzọ gaa. Ụzọ ya amasịghị ha maka na ọ gbara ndị agha ndị ọ kpọrọ ndị 'oke ụjọ' egbe. Ị ma na ọ bụghị onye agha azụrụ azụ, ọ batara dịka onye nkịtị, mana obi kara ya."" Ọ bụghị onye agha Naịjirịa tupu ọ banye n'agha Biafra."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43427357,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43427357,Uefa: A ga-ama mbe ndị bụ oke n'asọmpi Uefa na Europa,Ndị na-ahazi asọmpi Uefa Champịọns ahọpụtala otu egwuregwu dị icheiche ga-ezute ibe ya n'agba kwọta faịnalụ nke asọmpi ahụ.,"A ga-agba ngụcha asọmpi Uefa n'obodo Kyiv dịna mba Ukraine Iko Uefa Champịọns bụ ọkaibe nke na-esota iko mba ụwa n'iko niile gbasara asọmpi egwuregwu bọọlụ. Otu egwuregwu ndị ga-ezute ibe ha n'asọmpi Uefa Champịọns Anya otu egwuregwu niile a dị n'ebe iko Uefa Champịọns ahụ nọọ. Na nhọpụta ahụ emere taa, FC Barcelona ga-ezute AS Roma, Sevilla FC na FC Bayern Munich ga-achịpụya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Juventus na Real Madrid ga-amaaka, ebe Liverpool na Manchester City ga-agba. Asọmpi ndị ga-abụ n'abalị atọ na anọ nke ọnwa Epurelu. Arsenal ga-ezute ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa N'aka nke ọzọ ahọpụtakwara otu ga-ezute ibe ha n'asọmpi Europa. Arsenal ga-ezute CSKA Moscow, RB Leipzig na Marseille, Athletico Madrid na Sporting Liabon ga-achịpụ ya, dịka Lazio ga-anabata Red Bull Salzburg." afirika-46734165,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46734165,Dino Melaye: Daalụnụ ndị Kogi maka ịkwụnyere m,Dino Melaye bụ Sinatọ na-anọchite anya ndị si ọdịda anyanwụ Kogi steeti ekperela ndị steeti ya nakwa ụmụ Naijiria niile ekpere ngọzị maka ịwado ya dịka ndị uweojii na-achọ ya ka ha nwụchie.,"Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino Nke a n'eme dịka akụkọ pụtara n'otu otu abụghị nke gọọmentị a kpọrọ 'Justice Helpline Foundation' kwuru na ha ga-akpụpụ ndị uweojii ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha agwụsịghị iyija Melaye. N'ụtụtụ Wenezde, Dino Melaye tiri mkpu n'igwe Twitter na-ekwu nana ndị uweojii na-achọ ịkụka ọnụụzọ ụlọ ya. N'ihe nkiri o wepụtara ebe ọ nọ na-ekwu okwu ka onye na-agba izu, Melaye kwuru na 'ọ bụ Chineke usuniile nke ndị agha' ga-agbara ya ọgụ. End of Twitter post, 1 O kwuru na ọ bụghị ọsọ ka ya na-agba, kama na ọ bụ akọ na uche ka eji eme ihe. Lee ihe ndị mmadụ sara ya n'akara Twitter: @xtanburg kwuru ka Melaye kwupute mmehie ya ma were onwe ya nye na aka ndị uweojii. @FemiOmotee gwara ya na ọ na-ekwuru onwe ya. Mana ‏@ApostleDavidOdi kwuru na ụmụ Naịjirịa na-ekiri ihe na-eme nakwa ha agaghị ekwe ka ihe iwu na-akwadoghị na-eme. @dottee007 kwuru na ọ ma na ndị uweojii na-egbu oge makana Melaye bụ nwoke ma ihe onye na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43700467,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43700467,Ben Nwabueze: Wepụ IPOB dịka 'otu oyiegwu',Nwabụeze kwuru na e meghị nke a ndị okenye Igbo ga-ebuzi mbọ a na-agba maka nnwereonwe Biafra n'isi.,"Ben Nwabueze bụ onyeisi ndị Eastern Consultative Assembly Onye ọkaiwu ahụ kwuru nke a oge ndị otu IPOB gara n'ụlọ ya n'Atanị Anambra Steeti ịga rịọ ya mgbaghara maka ikposa nzukọ nke otu ndị okenye si ọwụwa anyanwu nke a kpọrọ, Eastern Consultative Assembly, na bekee, nke Nwabụeze bụ onyeisi ya, mere n' Enugu n'ọnwa Februwarị afọ a. O kwuru na ya a gaghị esonye na mkparịtaụka ọbụla gọọmentị etiti na-akwado ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ maha mmachi a machiri IPOB ma wepụ aha ha dịka otu 'oyiegwu'. Ọ sị:"" Ọ bụrụ na elebanyeghị anya na mkpagbu gọọmenti etiti na-akpagbu, ọ ga eru oge ọ ga bụ Igbo niile ga-esonye ha, ndị okenye dịka mụ ga-eburu ya n'isi. Nke a ga-abụrụ nsogbu kachacsi njọọ nye ala Naijiria."" Gọọmentị Etiti gụrụ IPOB nd O kwuru na mkpagbu a na-akpagbu Ndigbo na Naijiria butere mkpu akwa ndị IPOB. Ọ gakwara n'ihu kwu na mkpagbu ahụ bidoro na afọ 1965 oge konsul na achị na mahadum nke lagos, University of Lagos,' ebe ọtụtụ bụ ndị Yourba kpara nkịta iwepụ onyeisi mahadụm ahụ bụ onye Igbo a kpọrọ ọkammụta Enyi Njoku. ""Aka m na-echeta akụkọ ihe mere na University of Lagos n'ụbọchị ọnwa Maachị, afọ 1965 oge m bụ onye nkuzi na mahadum ahụ e mepere ọhụrụ. Ha chọrọ iwepụ ọkammụta Enyi Njoku dịka onyeisi mahadum mana a jụrụ ajụ. I kpọkọtara m ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi anyị mee ngagharịiwe mere ka emechie mahadum. ""Anyị lụsoro gọọmentị etiti nke Alhaji Tafawa Balewa ọgụ. A nwuchiri m ma ma m ọkaikpe onye Yoruba mara m ikpe mkpọrọ ọnwa isii maka idu na ngaghariiwe ahụ mana anyị gbagharịrị akwụkwọ ma otu onye ọkaikpe ,onye mba Sierra-Leonia bụ J.S Taylor kagburu ọmụma ikpe ahụ ma tọrapụ m, nm nwere ọnwe m. Ụbọchị nke a mere, Ndịgbọ niile nọ na Legos nwere oke ọnụ."" Otu IPOB na- agba mbọ maka nnwereonwe Biafra Ọ katoro gọọmentị etiti maka imachie IPOB ma hapụ Fulani na-achi ehi, ndị o kwuru na ha na-egbula ọtụtụ ndị Naijiria, ma ọ gụghị ha ""ndị oyiegwu"". "" A ghaghị m esonye na mkparịtaụka udo ọbụla sọsọ ma amahara IPOB, ndị , dịka o siri kwuo, egbula ọtụtụ ndị Naijiria, ma ọ gụghị ha dịka ""ndị oyiegwu"". "" A ghaghị m esonye na mkparịtaụka udo ọbụla sọsọ ma a tọpụrụ mmachi a machiri IPOB, ma e wepụrụ aha IPOB dịka otu oyiegwu. ọ bụrụ na gọọmenti etiti aka obi mezuo ọnọdụ abụọ, anyị akpa udo. ọ bụrụ na-ọbụghị otu a, gụpụ m."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45307330,https://www.bbc.com/igbo/45307330,Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti: Ka o si aga,"N'agbanyeghị na gọọmentị Imo steeti kwuru sị onye ọbụla emepela ahịa maọbụ ọrụ taa, onweghị onye rubere isi n'oku ahụ.","Ụlọahịa dị iche icheBBC Igbo gara na ya na-azụ ka o si azụbu. N'Okigwe, ọdụ ahịa niile meghere emeghe; etu ahụ ka ọ dịkwa n'okpuruọchịchị Ọnụimo, Isiala mbanọ, mbaitoli nakwa Ihitte Uboma, ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha. Mgbe BBC Igbo rutere na Nkwọ Ụmụezeala dị n'Ehime mbanọ, ahịa ahụ na-azụ dịka onweghị ntuliaka na-eme. Ahịa na-azụ n'Okigwe Otutu ụmụnwaanyị na-azụ ahịa ebe ahụ gbaara Gọvanọ Rochas Okorocha egwu ngala iji gwa ya na ha agaghị ebinye aka n'akwụkwọ. Ụmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti Ruo ugbua, ọtụtụ ụlọakwụkwọ anyị gara bụ ebe ekwesịrị ịnọ mee ntuliaka ka mkpụrụ mmadụ ole na ole nọ na-eche ndị ISEC na-ahụ maka ya. Ntuliaka okpuru ọchịchị nke gọọmenti Imo hiwere kwesịrị ime taa n'okpuruọchịchị 27 dị na steeti ahụ n'agbanyeghị ndọrọndọrọ sochiri ima ọkwa ahụ. Ka BBC rutere n'Okigwe ebe ndị na-edekọta aha, ndị mmadụ jupụtara na-eche ka ISEC bute akwụkwọ ntuliaka. Ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti Ndị ahụ ga-edenye aha ndị Mmadụ n'akwụkwọ na wọọdụ ha dị iche iche gwara BBC na ha anọrọla ebe ahụ kemgbe elekere asaa n'ụtụtụ a. Mana ruo mgbe o jiri ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ, o nwebeghị onye hụrụ ndị INEC anya. Ọtụtụ pati anoghị n'ọkwa ọchịchị esonyeghị Ọtụtụ ndị pati nọ na steeti ahụ esonyeghi na ntuliaka ahụ. Otu PDP kwuru na aka na ụkwụ ha adịghị ya n'ihi na o nweghị ozi e wetara ha banyere ya. Otu ọnye ma ihe a na-akọ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti bụ TEO Ekechi,gwara BBC na ntuliaka abụghị ezigbo ya n'ihi na 'mpụ na aghụghọ' emetọọla ya bụ atụmatụ. Ekechi kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche n'Imo steeti esepụla aka na ya bụ ntuliaka maka na ha ma na naanị ndị kwadoro gọvanọ Rochas Okorocha bụ ndị ga-enwe mmeri. Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Ọkorocha n'okwu gbasara soshal midia bụ Dr Ebere Nzewuji, kwuru na okwu ahụ bụ okwu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achịtaghị aja na ntuliaka. Nzeworji, ""Gbaa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị achịtaghị aja na ntuliaka nkịtị. ""APC na pati ndị ọzọ so na ntuliaka a."" Ka o si gaa na ntuliaka Okpuruọchịchị Imo steeti Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49262305,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49262305,"Tekno Arrested: Ndị Uweojii anwụchighị Tekno, ọ biara zaa ajụjụ","N'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ndị mmadụ hụrụ ụgbọala bu Tekno onye ezigbo aha ya bụ Augustine Kelechi na ụmụnwaanyị na-eyichighi ahụ na-agba egwu n'okporoụzọ Lekki dị na Legọs steeti.","Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs Steeti bụ Bala Elkana ekwuola na ha anwụchighi Tekno, kama ha kpọrọ ya n'ụbọchị Tuzdei ka ọ bịa zara ajujụ maka ihe mere. Ọ kwukwara na ha kpọrọ onye na-elekọta Tekno ma kwa ndị niile aka ha dị na ya nke tinyere ụmụabọghọ ahụ yi mbenukwu, ka ha bia zara isi ha. Elkana kwukwara na ndị uweojii ka n'eme nyocha. Tekno na onwe ya apụtabuola n'igwe Instagram rịọ mgbaghara ma kwuo na ọ bụghị mgbasaozi maka ebe ụmụnwaanyị na-agba ọtọ agba oringo ka ha na-eme. A chụpụrụ nwaanyị onye omeiwu maka iku nwa ya dị ọnwa ise bịa ụlọomeiwu Hassan sị na o nwere ihe dapụtara ya n'ike mere ya jiri kuru nwa ya dị ọnwa atọ bịawa ụlọomeiwu A chụpụla nwaanyị onye omeiwu mba Kenya bụ Zulekha Hassan n'ụlọomeiwu mba ahụ maka iku nwa ya dị ọnwa ise bịa ọrụ. Hassan kwuru na o nwere ihe dapụtara nike ụlọ ya mana Christopher Omulele, bụ onyeisi ụlọomeiwu mba ahụ onye nyere ntuzuaiaka ahụ kwuru na ụlọomeiwu abụghị ebe a na-elekọta ụmụaka. Okorocha asaala Ihedioha n'ọdịda akpụrụakpụ ya Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti Aka chiburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na gọvanọ nọ ugbua bụ Emeka Ihedioha na-eji abali akụtusi ihe ọ rụrụ ma kwuo na ha dara n'onwe ha. N'ozi si n'aka onye ndụmọdụ bụ Sam Onwuemedo pụta, Rochas sị Ihedioha na-ebuso ya agha n'ihi mmeri o meriri PDP n'afọ ndị gara aga. Ụlọikpe akagbuola iwu Sịnetị nyere Edo Steeti Ulọikpe dị n'Abuja nọrọ ụbọchị Wenezde nyee Ụlọomeiwu Naijiria iwu ka ha sepụ aka n'okwu gbasara iweghara ụlọomeiwu Edo steeti. Cheta na gọọmenti Edo steeti gbara akwụkwọ n'ụlọikpe iji gbagha iwu ụlọomeiwu etiti nyere ya ka o kposala ụlọomeiwu steeti ha hiwere. N'egwuregwu Nwafọ mba Yuregua a ma ama n'ịgba bọọlụ bụ Diego Forlan awụsala ọwa dịka ọgbachara bọọlụ afọ iri abụọ na otu. Forlan gbara bọọlụ n'otu egwuregwu ndị dịka Manchester United, Atletico Madrid, Inter Milan na ndị ọzọ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkịrị ga-amasị gị - Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro Mwakpo nwantakịrị n'Imo steeti Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando ekwuola na aka akparala otu nwoke dinara nwatakịrị nwaanyị n'ike. O kwuru na ọ bụ ngalaba uweojii nke SARS Imo steeti nwụchiri otu nwoke aha ya bụ Onyekwere Umunna gbara afọ iri isii maka idina nwatakịrị a dị naanị afọ asaa n'ike. Umunna ekwenyela na ebubo eboro ya bụ eziokwu. Otiinwata echerela ndị mba Zimbabwe aka mgba Amabu Zimbabwe dịka mba kacha emepụta achịcha. Agụụ na-akwado ịgụgbu ihe karịrị mmadụ nde ise na mba Zimbabwe dịka oke ọkọchị nke ụkọ mmiri ozuzo na-ebute, ajọ ifufe na nsogbu enweghi nnukwu akụnaụba, na-asụ Zimbabwe akwụ. Ndị World food program na ngalaba United Nations na-agba mbọ ịnakọta ego ga-eru nde Dọla narị atọ na ọma nke a ga-eji gbatara ha ọsọ enyemaka. N'Ofesi Ezuikwara ohi n'Casa de Moneda n'afọ 2018 Ọ bụ na mba Mexico ka ndị ojiegbe ezu abụọ maburu egoigwe ọlaedo nke ruru nde dọla abụọ were gbalaga. Ndị uweojii na-enyo ndị ọrụ nke ụlọakụ Casa de Moneda ebe e zuru ohi a n'ihi na ha na-akọwa na o nwereike ịbụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ohia na azụ dị n'ofe. N'Egwuregwu Taiwo Awoniyi agbabeghị Liverpool bọolụ kemgbe 2015 ha zutara ya Liverpool ebinyela otu egwu bọọlụ FSV Mainz nke spain nwaafọ Naịjirịa bụ Taiwo Awoniyi. Awoniyi dị afọ iri abụo na otu anọọla na Liverpool kemgbe afọ 2015, kama o sobeghi ha gbaa bọolụ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee akụko ga-amasi gị -" afirika-48987592,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48987592,National Security Summit: Ka anyị hibe ọgbakọ maka nchekwa Naịjirịa,Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ekwuola ka ewere ọsọ were ije hibe ọgbakọ ga-etinye anya na nsogbu gbasara nchekwa n'obodo Naịjirịa.,"Ha nwere nkwekọrịta a n'nzụkọ nke ha nwere na ụbọchị Tuzdeị 16 Julaị n'Abuja. Ọ bụ onyeomeiwu Sinatọ Ayo Akinyelure (APC-Ondo) bulitere okwu a maka mgbagbu a gbagburu nwa Pa Reuben Fasoranti bụ onyeisi ndị otu Afenifere; Funke Olakunrin. Nwa Fasoranti e gburu Ndi omekaome gbagburu nwaanyị a n'ụzọ Akure-Ore n'Ondo Steeti n'ụbọchị Fraịde. 'Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ' Onye ụlọomeiwu Sinatọ Tolu Odebiyi tinyekwara ọnụ n'okwu a were si na; ""O nweghi ihe ọbụla anyị na-eme ebe a nwere isi ma ọ bụrụ na anyị enweghi ike ichekwa ndị Naịjirịa."" O kwukwara sị ""Kedụ uru ọ bara ma anyị bịa ebe ụbochị niile were otu nkeji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu ma ụmụ Naịjirịa na-anwụ kwa ụbọchị"". Buhari asaala edemede Obasanjo N'aka nke ọzọ, aka na-achị Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari azaala ndị na-akatọ ya maka enweghị nchekwa n'Naijirịa kwuo na ha niile enweghi mmụọ ihu Naịjirịa n'anya n'ime ha. Buhari kwuru nke a dịka ya na ndị ""Buhari Campaign Organisation"" nwere ọgbakọ n'ụlọ onyeisiala nke dị na Abuja. Onyeisiala gara n'ihu kọwaa na ndị a na akatọ ya maka mpu na ajọ ihe n'eme n'ebe dị iche iche nke a na enweghi ihe jikọtara ha ọnụ n'obodo Naịjirịa . Buhari kwuru na mpụ na ajọ ihe a na-eme kwa n'obodo dị iche iche n'uwa niile gburugburu. Ndị na-akatọ m abughị ezi ndị amaala Ọ kọwakwara na ndị ntọrị na ndị ọmekome chere uwa niile gburugburu aka mgba. Okwu Onyeisiala Buhari Kwuru na-eso akwụkwọ ozi aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo dere ya maka ọnọdụ nchekwa na Naijirịa nke ọ kọwara na ọ na akanwanye njọ. Lee ọkpụrụkpụ ihe asaa Obasanjọ kwuru na akwụkwọ ahụ o dere Ma Obasanjo ma Buhari achịbuola Naijiri dịka ndị agha n'oge gara aga 1.Ọgbaaghara nwere ike ịda n'ihi na ndị mmadụ enwezighị ntụkwasịobi na gọọmentị ga-echekwa ha nke ọma. Nke a ga-eme ka onye ọbụla chọwa ụzọ ichekwa onwe ya, nke nwere ike ibute ọgbaaghara n'obodo. 2.Aka ike agaghị akwụsị Boko Haram. Gọọmentị kwesịrị ileba anya n'okwu agụghị akwụkwọ na enweghị orụ bụ nke kpatara ndị ntorobịa bi na mpaghara ugwu Naijiria ji esonyere ndị Boko Haram. 3.Gịnị ka ndị Fulani ọchiehi chọrọ: Obasanjo kwuru: ""Ihe ọbụla bụ iwe ndị Fulani, ha kwuo ya ka e lebaa ya anya, mara otu a ga-esi mee ya. ""Enwekwaa ndị ọzọ iwe dị n'obi, ha kwupute ya ka e lebaa ya anya. ""Mmiri ọjọọ na-eji na Naijiria, mmiri a ga-ebute mbibi, ọgbaaghara na mgbasa ma o zoo."" 4.Kpọọ ọgbakọ ndị ma ihe ekwe na-akụ: Ndị Obasanjo che na ha kwesịrị isonye n'ọgbakọ a bụ: ndị eze ọdinala, ndi isi ndị agha na ndi isi ndi uweojii (tinyere ndị larala ezumike), ndị isi okpukpere chi, ndị obodo ebe enwere ọgbaaghara, ndị gọvanọ (tinyere ndị pụrụla n'ọchịchị), ndị nnọchite anya Naijiria na mba ọzọ, wdgz. 5.Hapụnụ ịta onwe ụnụ ụta. Obasanjo kwuru na ịta ụta na-eme ka obi daa mmadụ mba ma mee ka onyeiro siwanye ike. O gara n'ihu kwuo na ""ihe jọwa njọ, onye a ga-ajụ bụ onyeisiala"". 6.Igwe bụ ike Obasanjo kwuru na ihe niile gọọmenti na-eme kwesịrị ịbụ maka ọdịmma nke ọha obodo. Nke a ga-eme ka ndị ọha obodo na-adọnyere gọọmentị ukwu mgbe niile. 7.Ihe mere na Yugoslavia nakwa Ruwanda nwekwara ike ime na Naijiria Obasanjo kwuru na ma gọọmentị emeghị ngwa ngwa iji meghara ọdachị, ihe mere na Yugoslavia nakwa Rwanda n'oge gara aga nwere ike ime. ""Chineke ekwela ihe ọjọọ!"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42786449,https://www.bbc.com/igbo/42786449,Google akwanyerela Keshi ugwu n'ọnwụ,"Iji cheta ọmụmụ onye nkuzi bọọlụ Najiria a ma ama bụ Stephen Keshi, Google kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụiche site na ime ka akara e ji achọta ihe n'igwe intanetị bụrụ ihu ya.","Google na-echeta ụbọchị ọmụmụ Keshi Taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenuwarị 2018, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Keshi onye nwụrụ n'afọ 2016 ka ọ gbara afọ 54. Google Africa kwuru n'igwe okwu Twitter sị: ""Taa, anyị na-akwanyere onye egwuregwu bọọlụ a ma ama, Stephen Keshi ugwu. Egwuregwu bọọlụ bugharịrị Keshi ụwa niile dịka onye ọgba bọọlụ na onye nkuzi bọọlụ. Ọnụ ọmụmụ, nna nnukwu!"" End of Twitter post, 1 Ihe a Google mere, mere ọtụtụ ndị Naijiria obi ụtọ, mekwa ka ha chetakwa ndụ na ike Keshi kpara n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na Naijiria mgbe ọ dị ndụ: Keshi meriri iko mba Afrika na 2013 Mutiu Adepoju, onye ya na Keshi gbakọrọ Naijiria bọọlụ, gwara BBC na, ""Keshi bụ onye hụrụ ndị mmadụ n'anya. Echetara m oge m banyere ""National Team"" mgbe ahụ ọ bụ onye ndu anyị, ọ bụ ezi onye ndu. Keshi bụ onye a ma ama. Ọ nọzịghị ndụ mana a ga-eji ihe ọma ndị o mere mgbe ọ dị ndụ were na-echeta ya."" Keshi chịrị ndị otu egwuregwu Super Eagles kemgbe afọ 2011 ma durukwa ha gaa asọmpi dị iche iche nke gụnyere; Iko Mba Afrika na 2013 (nke ha bulatara Naịjirịa), iko mpaghara Afrịka dị iche iche na 2013, ma nye aka wetara Naijiria ọnọdụ n'asọmpi Iko Mbaụwa niile na 2014." egwuregwu-49946491,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49946491,Brighton vs Tottenham: Asapụla tottenham ọcha ka azụ ite,Oke anya ajụ na-apa ndị Tottenham site n'ọkpụ goolu atọ a na-asataghị otu ndị Brighton ji saa ha isi.,"Dịka asọmpi melitere na nkeji 3, Brighton ji otu ọkpụ goolu sị n'aka Neal Maupay sị ndị Tottenham 'Unu abịala'? Tupu Tottenham ahọta ihe egwu na-akụ, Aaron Connolly nke Brighton nyere ha goolu ọzọ na nkeji 32. Nke a tinyere Tottenham na gbagharịa dịka ha enweteghi onwe ha ruo na ngwụcha ọkara mbụ. N'ime ọkara nke abụọ na nkeji 65, nwa amadị Aaron mere onwe ya aha ọzọ mgbe o mezuru goolu ha ọkpụ atọ. Tottenham siri ọnwụ niile ha nwereike ka ha nyeta ọ bụ naarị otu ọkpụ goolu mana Brighton foro ntụtụ taa na nke a agaghị eme. Cheta na Bayern Munich gbara Tottenhem ọkpụ goolu asaa asatara abụọ n'ụlọ n'asọmpi Uefa Champions League n'ime izuụka a. Mmeri a e meriri Tottenham dosara ha na ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League." 42791512,https://www.bbc.com/igbo/42791512,Obasanjo agwala onyeisiala ka o chefuo ịzọ ọchịchị 2019,Buhari onwere ike ịzọ ọchịchị oneyisiala n'afọ 2019?,"Obasanjo degakwara Goodluck Jonathan akwụkwọ oge ọ nọ n'ọchịchị Onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo degara onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ taa gwa ya ka ọ laa ezumikenka ma ọ chịcha agba nke a maka afọ ole ọ dị nakwa ahụ ike ya. N'akwụkwọ ahụ o dere dị ibe iri na atọ, Obasanjo kwuru na onyeisiala Buhari anaghị eme nke ọma. Obasanjo kwuru na Buhari emeghi etu a tụrụ anya n'aka ya oge o were ọchịchị, ka o jiri aka ya dụọ onwe ya ọdụ ma ""ridata n'inyinya ahụ"" sonyere ndị chịbụrụ ala Naịjirịa were amamihe na-etinye anya n'ọchịchị ala naịjirịa. O kwuru na onyeisiala Buhari bụ onye ọ kwadoro n'afọ 2015 agbawala ya obi. Obasanjo kwadoro Buhari na mmegide onye na-achị oge ahụ bụ Goodluck Jonathan. N'afọ 2013, Obasanjo dekwara ụdị akwụkwọ a nye onye na-achị oge ahụ bụ Goodluck Jonathan nke ọ kpọrọ ""Tupu oge agaa"" (Before Its Too Late). Nke a degara Buhari, ọ kpọrọ ya ""Ụzọ ọpụpụ: Oku Ikpọkọta ndị Naijịrịa maka ọdịn'ihu"" (the Way Out: A Clarion Call for Coalition for Nigeria Movement). Obasanjo achịbuola ala Naịjirịa ugbo abụọ n'okpuru ọchịchị otu pati PDP. O kwuru na ihe ndị merelanụ kamgbe 2015 gosiri na akwụkwọ ya degara Jonathan oge ahụ bụ ihe ziri ezie maka ihe na-eme oge ahụ." afirika-44478755,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44478755,Ogbugbu Igwe: Obodo Ogbozinne dịzị ka ebe agbara ọsọ agha,Obodo Ogbozinne Akpugo dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West n'Enugwu steeti nọ na nnukwu nsogbu ugbua n'ihi na ha tigburu igwe na-achị obodo ahụ.,"Ọnwụ Igwe: Ihe kpatara ya Ogbozinne ahụ dịzị ka ebe agbara ọsọ n'ihi na ndị ụmụnwoke na ndị ntoroọbịa agbaala ọsọ n'obodo ahụ maka egwu ndị uweojii. Mgbe BBC Igbo rutere n'Ogonogieji Ndiunọ nke Ogbozinne nọ n'ime ya, a hụrụ na ọtụtụ ọnụ ụlọ gbachiri agbachị ebe ndi bị na ha gbagara n'obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Ebe a na-atụ mgbere n'Akpugo dị chako Naanị otu nwaanyị kwere ka-agbaa ya ajụjụ ọnụ n'ihe onyonyo kwuru na ọ bụ aka nchịgbu Igwe Steven Nwatu ji na-achị ndị Ogbọzinne mere ndị obodo jịrị kaa obi gbuo ya. Ọ kwara arịrị na ka mgbe afọ iri onye eze ahụ were ọchịchị, ahụ afọzighị ndị obodo ahụ ha n'ihi na onye ọbụla na agba nkwụ, ili ozu ma ọ bụ mmemme ọbụla ga akwụnyere akatankpo ego n'aka Igwe na ndị otu ya. Agbara ụlọ ọkụ n'Akpugo Nwanyị ahụ boro Igwe Steven Nwatu nwụrụ anwụ ebubo na ọ na-eji ndi uweojii SARS na-akpụrụ ma kpọchikwaa onye ọbụla ọchọrọ n'ụlọ mkpọrọ. Dika ndị ọzọ zara ajụjụ onụ siri kwo, na ndị obodo kwadoro igakwa ọzọ kpesara Governor na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi esomokwu di n'etiti ha na Igwe Nwatu. Ngwa ngwa ha zukọrọ ka Igwe na ndị uweojii SARS bịakwara ọzọ ịgbasa nzụkọ ndị obodo. Ha kwuru na Igwe were ụgbọala ya kụjie otu nwa okorobịa ụkwụ, tinyekwara na ndị SARS na-agba egbe aghara aghara, ndị obodo gbakọrọ ọnu gbaa ya bụ Igwe ọtọ, tie ya ihe. Akpugo dizi ka ebe agbara ọsọ agha E buzị ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nwụrụ dịka ọ na-anata ọgwụgwọ. Ọtụtụ ndị obodo kwuru na ọbụ maka na Igwe ekweghị ka-ehiwe ọgbakọ obodo bụ 'Town union' n'obodo ahụ butere ọnwụ ya. Ọtụtụ ụlọ bụ nke amụnyere ọkụ ebe emebikwara ụfọdụ n'obodo ahu. Okoroọbịa na ndị ụmụnwoke okenye agbala ọsọ n'obodo a Banyere okwu ndị SARS ndị mmadụ na-ekwu na-eso igwe a, onye na ekwuchitere ndị uweojii ọnụ ha n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu ekwuola na-aka ndị uweojii SARS adighị na esomokwu ahụ kpatara ọnwụ Igwe n'Ogbozinne Akpugo.Okwu a bụ iji saa ebubo ụfọdụ ndị obodo ahụ boro, na Igwe ahụ nwụrụ anwụ du ndị SARS na-akpụkọsị ndị mmadụ na agba egbe aghara aghara nke butere nsogbu. Otu nwanyị gwara BBC Igbo na-ya ji anya ya hụ ka ya bụ Igwe Steven Nwatụ na ndị SARS gara ebe umu nwoke gbakọrọ ịga njem ga hụ Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị. Oteghịzi aka, alụba ọgụ, were tigbue Igwe.Ebere Amaraizu kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu. Ọ sịrị na ndị uwe ojii anoghị ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere, wee sị na ọ bụrụ na ndị uwe ojii nọ ebe ahụ, ha agaghị ekwe ha tigbue igwe ha.Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na-ntị ka ha ghara ịdị na ebo ebubo na enweghị isi.Amarizu kwuru na ndị na ekwu ihe dị etua na agbachịrị uwe ojii ụzọ ịchọpụta ndị kpara arụ ahụ.O kwekwara nkwa na ha mee elu mee ala ndị uwe ojii dị njikere ịhụ isi ya bụ ihe ma na echekwaba ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ oge niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47437858,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47437858,Abia Election Results: Ikpeazu eburula ụzọ n'Abia steeti,Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ka kwụ chịm ugbua dịka o meriri ntụlịaka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.,"Ọ bụ na mgbede ụbọchịụka ka akpọpụtara aha ya dịka onye meriri mgbe a gụkọchara mpụtara si n'okpuruọchịchị niile dị n'Abia. Ndị na-anọchite anya ndị APC na APGA ji iwe apụ n'ebe a na-eme mkpọpụta mpụtara n'Abịa steeti ugbua. Ha kwuru na ha agaghị anabata mpụtara a na-akpọpụta. Lee ka e si akpọpụta ya nakwa ihe bụ iwe ha ebe a. Alex Otti na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abịa steeti kwuru na o nwere olileanya na ebumnuche ndị mmadụ ga-emezu. O kwuru nke a n'elu Twitter ya ka ọ tụchara vootu. O kwukwara sị na udo dị ebe ọ nọ mee ntuliaka, kama na ọ nụrụ kepu kepu na e nwere ndị nwara ike ha imaburu igbe ntuliaka. Ọ rịọkwara Inec arịrịọ ka ha gbaa mbọ lebanye anya n'okwu a. Ikpeazu na-atụ anya mmeri: Ikpeazu na-azọ ịchị Abịa steeti n’agba nke abụọ ya ekwuola na o kwenyere na mmeri ya kpam kpam. Election 2019: 'Ama m na mmeri ga-abụ nkem' Ihe ndị ọzọ o tinyere ọnụ na ya bụ okwu gbasara ndị nchekwa na ụzọ ha si esonye n'igbochi nrụrụaka. Ntuliaka ebirila ọkụ n'Abịa steeti ugbua, dịka ndị mmadụ na-atụ vootu ha. Okezie Ikpeazu bụ aka na-achị Abịa ugbua ma na-atụ anya ịlọghachịte ọzọ, atụọla vootu ya na wọọdụ ya dị n'Umuobiakwa n'Obingwa. Nwunye ya sokwa tụọ vootu N'Enugwu na Ebọnyị Dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febrụwarị a, ị ma ndị na-azọ ọchịchị n'Enugwu na Ebọnyị steeti? N'agbanyeghi na ndị na-achị steeti abụọ a na-atụ anya ịlọghachịta ọchịchị nke ugboro abụọ, e nwere ndị na-atụkwa anya ịnapụta ha ọchịchị n'aka. BBC Igbo na-egosi mmadụ atọ ndị a kacha kpụrụ n'ọnụ n'ime igwemmadụ pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti abụọ a, na ebumnobi ha ma ọ bụrụ na ha zọta ọchịchị. Dịka anyị si hụ ebe ndị mmadụ binyere aka ịhọpụta ndị ha ga-atụnyere vootu, lee ndị kacha welite isi na steeti abụọ a. ENUGWU STEETI: 1) Ifeanyi Ugwuanyi: Ugwuanyi bụ onye na-achị Enugwu steeti ugbua, na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP). Ugwuanyi a ma dịka ""gburu gburu"", na-ekwe nkwa ịrụ ọrụ karịa ihe ọ rụrụ n'agba nke mbụ ọ chịrị. Ihe kacha tụọ ndị mmaọ̄ụ n'anya bụ etu ihe karịrị pati iri atọ kwụsịrị ịzọ oche gọvanọ n'Enugwu steeti, ka ha nwee ike ikwado ya. Ugwuanyi dị afọ 54, kwere nkwa ezi ọchịchị, ịhụ na ndị mmadụ nwere ọrụ, imepe obodo nakwa nchekwa oge ọ zọtara ọchịchị n'afọ 2015. Orji Jide Abraham: Ọrji dị afọ 43 na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati National Action Council (NAC) nke ọ bụkwa onyeisioche ya n'Enugwu steeti. APC Otu pati APC enweghi onye na-anọchite anya ha, makana ha nwere okwu n'ụlọikpe gbasara ndọrọndọrọ dị n'etiti Ayogu Eze na George Oghara na-azọ onye natara ikike ife ọkọlọtọ pati ha. Nke a mere ka Inec wepụ aha ha n'akwụkwọ. EBỌNYỊ STEETI: David Umahi: Ọ bụrụ na Umahi na-azọ ọchịchị n'okpuru Peoples Democratic Party (PDP) zọta oche nke 2019, ọ ga-abụ nke agba abụọ ọ ga-achị steeti ya. Ọ rụrụ dịka osote gọvanọ oge Martin Elechi chịrị Ebọnyị n'afọ 2011. Umahi dị afọ 55, nọ ọnọdụ ugbua dịka onyeisioche ndị gọvanọ si mpaghara ọwụwa-anyanwụ. ""Akụbaraọha"" dịka ndị mmadụ na-etu ya, gụrụ akwụkwọ dịka ihe bekee na-akpọ ""Civil Engineer"". O kwere nkwa ịrụ ọrụ karịa ka ọ rụrụ ma ọ bụrụ na a tụnyere vootu ga-eme ya gọvanọ ọzọ. Sunny Ogbuoji: Ogbuoji dị afọ 64 na-azọ ọkwa ọchịchị n'okpuru All Progressives Congress (APC), bụ sinetọ na-anọchi anya Ebonyi Saụt kemgbe afọ 2011 ruo 2019 a. Ọ rụọla ọrụ dịka onyeisi okpuruọchịchị Afikpo, oge ndị agha na-achị Naịjirịa. Ọ rụkwara ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka mwepụ ụbịam na ikwalite akụnaụba obodo oge Martin Elechi bụ gọvanọ Ebọnyị steeti. O si na PDP gafee APC, n'agbanyeghị na ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-achịkọta achụmntavootu Goodluck Jonathan na Namadi Sambo. Ogbuoji na-ekwu na ọ bụrụ na ọ zọta ọkwa gọvanọ, na ọ ga-agbado anya n'ịchịkọta Ebọnyị n'ụzọ niile, ma hụkwa na e were ọtụtụ ndị Ebọnyị n'ọrụ. Chibueze-Agbo Ndubuisi Onwe: Chibueze-Agbo dị afọ 46 na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Social Democratic Party (SDP). Chibueze-Agbo rụburu ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ oge Martin Elechi na-achị dịka gọvanọ Ebọnyị. O kwuru na ọ bụrụ na ọ zọta ọkwa gọvanọ, na ọ ga-gbado anya n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, ahụike, nchekwa nakwa ọrụ ugbo. Ọ sị na gọọmentị ya ga-enye ntorobịa ọbụla si Ebọnyị N120,000 ha ga-eji bido ọrụ, nke ha ga-akwụghachị gọọmentị puku narị n'ime ya ma ọnwa isii gafechaa. O si APC ebe ọ nọ na-azọbu oche n'ụlọomeiwu nta, gafee SDP ebe ọ na-azọ ọkwa gọvanọ, n'afọ 2018. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46427160,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46427160,N800b subsidy: Gọọmentị ọ ga-akwụli ya n'ime ụbọchị asaa?,"Odee akwụkwọ otu akpọrọ ""Major Oil Marketers Association of Nigeria MOMAN"" bụ Clement Isong agwaala BBC na-onweghị mgbe ha nyere gọọmenti iwu na ha ga-agba abụbọ ọrụ.","Ụkọ mmanụ ụgbọala na-adị karị ma mmeme Keresimesi ruwe na Naịjịrịa O kwuru na naani mkparịtaụka bụ ihe ha ji agwa gọọmenti etiti na ha kwụọ ha ụgwọ. N'ọnụ ya, ""Ndị nọ ọchịchị ugbua natara ụgwọ ha ji anya n'aka ndị nọbụ n'ọchịchị, ha kwụrụ ya bụ ego enyemaka gọọmenti mana ha akwụghị ọmụrụ nwa di n'elu ya."" Mana odee akwụkwọ Independent Petroleum Marketers Association bụ Danladi Pasali gwakwara BBC na ha ekwughi na ha ga-agba abụbọ ọrụ kama na ha kwụ ebe ndị otu ndị ọzọ na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala kwụ bụ ka akwụọ ha ụgwọ ha. ""Otu anyị enweghị ikike igba abụbọ ọrụ. Anyị bụ ndị ji ego achụ ego na ngalaba ọrịre na ọzụzụ mmanụ agbịdị mana gọọmentị ji anyị ụgwọ."" ""Anyị na ndị ụlọọrụ Debth Management Office DMO na-enwe mkparịtaụka ka e wee kwụọ anyị ụgwọ."" Pascali kwetekwara na ego ahụ ruru ijeri narị naira asatọ nakwa ụlọomeiwu ekwuola ka akwụọ ha ụgwọ a ebe gọọmenti na-agba mbọ ikwu ha ụgwọ a. Cheta na akụkọ pụtara na mbụ kwuru ndị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enyela gọọmeentị etiti ụbọchị asaa ka ha kwụọ ha ego ruru Ijeri naira narị asatọ (N800b) maka ego enyeamaka mmanụ ụgbọala gọọmentị na-enye. Ha kwuru na ọ bụrụ na akwụghị ha ego ma ụbọchị asaa gafechaa, na ha ga-agba abụbọ ọrụ. Ha kukwara na ha ga-akwụsị orire na ọzụzụ mmanụ n'ọdọ mmanụ ụgbọala n'akụkụ obodo Naịjirịa di iche iche maọbụrụ na akwụghị ha ego n'aka. ""Major Oil Marketers Association of Nigeria,(MOMAN),"" ""Depot na Petroleum Products Marketers Association (DAPMA)"" nakwa ""Independent Petroleum Products Importers (IPPIs)"" kwuru na ha ga-eme ka ndị ọrụ kwụsị ọrụ n'ike maọbụrụ na ha enweteghị ego a ma ụbọchị asaa gafechaa. Akụkọ kwuru na ụlọakụ ewegharala akụ na ụba nakwa ego ha ji azụ ahịa nke bụ na enweghị nke ha ga-eji kwụ ụgwọ ha ji. Kee mgbe ahụhụ a ga-ebi? Ajụjụ ndị Naịjirịa kpụ n'ọnụ Ha kwuru na ọ bụ naani gọọmenti ga-enyere ha aka maọbụrụ na ha kwụọ ha ụgwọ a. Onye ọkaiwu IPPI bụ Patrick Etimkwuru na kamgbe ọchịchị Buhari bidoro, na ha na gọọmenti enweela ọgbakọ ka ha wee kweta na ha ga-akwụ ụgwọ enyemaka nke pụtaranụ mgbe ndị ọchịchị Naịjiịa garaaga na-achị. Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na ha akwụtụla ya bụ ego mana ego enyemaka si n'aka gọọmenti ha ka ga-akwụ akwụ ka hiri nne. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-47758300,https://www.bbc.com/igbo/media-47758300,Pope Francis emeela ihe Pope ọbụla emebeghi mbụ,Onyeisi ndị ụka Katọlịkị n'ụwa niile bụ Pope Francis emela ihe Pope ọbụla embeghi mbụ mgbe ọ gara njem nleta n'ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị Imam nke ụka alakụba.,"Njem a so n'ihe ndị o mere iji kwalite mmekọrịta n'eiti ndị ụka Kristi na ndị na-ekpere Allah na mba ahụ dịka onyeisiala ha siri rịọ ya. Ihe mere na Akwamozu Eze Aguleri BBC IGBO nọ n'ọgbọ ebe a na-akwa Igwe Aguleri nwụrụ anwụ a na-akpọ Igwe Christopher Nwabụ nwanne Ijigo nke anọ. Otu omenala dị icheiche nọ n'ọgbọ ne-emepụta ihe iji kwanyere Igwe nwụrụ anwụ ugwu ikpeazụ. Gụọ akụkọ yiri ya ebe a 'Igwe Aguleri ọhụrụ abụghị Igwe anyị' N'egwuregwu, Otu Watford eriela goolu abụọ n'aka otu Man U dịka ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig taa. Gụọ akụkọ ahụ n'uju ebe a: Chi ndị Man U azọọla ha n'aka ndị Watford Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Ancient wars: Lee ụfọdụ agha Igbo gbara ike na ya Inec ga-enye pati umengwụ ọsọ Inec ekwuola na ha ga-ewepụ aha pati ndị agbanyeghị mgbọrọọgwụ n'akwụkwọ ha. Ha kwukwara na ha ga-enyonye anya n'etu otu pati dị iche iche si mefuo ego n'ọsọ achụmta vootu ha mere ma e kwucha okwu gbasara mmeju ntuliaka 2019. Onnoghen agbaghaala ikpe ya Justice Walter Onnoghen Ụlọikpe pụrụ iche a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal' na bekee ajụla ịnapata arịriọ Walter Onnoghen na ya enweghị okwu ọbụla n' akwụkwọ a gbara ya maka akpọpụtaghị akụ o nwere dịka onyeisi ọkaikpe Naijiria. Ka nke a na-eme Onnoghen ewegala ikpe ahụ n'ụlọikpe mgbegharị dị n'Abuja sị ka ha wezụga mkpebi 'tribunal' na ọ bụ ikpe mkpegbu. Trump agbachiela agbata ha na mba Mexico? Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ha agbachi agbata ha na mba Mexico ịzụụka na-abịa abịa, dịka o na-ebo gọọmenti mba ahụ ịgba nkịtị ndị mbịarambịara sị ala ha awụjụ mba Amerịka. Ikpa oke agbụrụ akarịala - Ndị nchịkọta bọọlụ Ndị nchịkọta Premier League; Guardiola,Klopp, Sarri na Warnock Ndị na achịkọta egwu bọọlụ na Premier League gụnyere Pep Guardiola na Jurgen Klopp na-eti mkpụ ka elebanye anya n'okwu ịkpa oke agbụrụ nke ha tụrụ arịrị na ọ na-akawanye njọ n'Yurop." afirika-52401642,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52401642,Igbo Tradition: Uru egwu ọnwa bara na ọzụzụ na njikọ ndị Igbo,"Tupu agụmakwụkwọ abata n'ala Igbo, e nwere ụzọ dị icheiche e ji akụzirị ụmụaka ihe.","Ndị Igbo na-atụ ilu sị na 'ịpụ egwu ọnwa bụ ure maka na onweghị onye ọnwa anaghị apụta na be ya Otu n'ime ha bụ nke kacha pụta ihe bụ egwu ọnwa. Na-agbanyeghi na a na-akpọ ya egwu ọnwa, ọ pụtaghị na ọ bụ sọsọ egwuregwu ka a na-egwu. Uru egwu ọnwa bara n'ala Igbo n'oge gboo buru ibu. Oge e ji eme egwu ọnwa Igbo Tradition: Uru egwu ọnwa bara n'ala Igbo n'oge gboo Iji mee nchọpụta maka akụkọ a, BBC Igbo kpọtụụrụ Obinna Okoro onye e ji 'Achara Man' mara, bụkwa onye ihe gbasara omenala Igbo doro anya nke ọma. Ọ kọwara na ọ bụ oge ọkọchị ka e ji agba egwu ọnwa. Nke a bụ maka na anaghị atụ egwu na mmiri nwere ike izo chụbaa ndị mmadụ n'ime ụlo. Ọzọkwa bụ na ọ bụ oge arụcharala ọrụ ubi nke ndị Igbo na-ahụta dịka oge ezumike. Okoro kwuru sị: ""N'oge ahụ, ọbụghị naanị ụmụaka na-aga n'ọgbọ ebe a na-agbakọ maka egwu ọnwa."" ""Onye ọbụla ma okenye ma nwata na-aga, onweghikwanụ onye na-atụ egwu na ndị ohi nwere ike ịba na be ya zukọọ ihe o nwere."" E tu e si akụzi ihe n'oge egwu ọnwa Ọ bụ na-ama egwuregwu obodo ka a na-agbakọ agba egwu ọnwa Nke mbụ, dịka Mazị Okoro si kọwaa bụ site n'akụkọ ifo. ""Ndị okenye na-akọrọ ụmụaka akụkọ iduu na ọba. Akụkọ ndị abụghị ihe mere eme kama ha bụ akụkọ e ji akọwa na ihe ọjọọ jọrọ njọ."" Nke ọzọkwa bụ iji aha ndị mere arụ n'obodo agụ egwu iji kwaa ha emu ka ndị ọzọ wee mụta ihe. Okoro kwuru sị: ""Onye zuo oshi a ga-eji aha ya mepụta egwu ka ihere ya mee ya nakwa ka ụmụaka mụta na oshi adịghị mma."" ""Mmadu dịnaa nwanne ya, a ga-ejikwa ha mee ihe akaja ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ"" ""O nwee onye mụrụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ, a na-eji aha nwa ahụ gụọ egwu ọṅụ wee kuziere ụmụaka uru nwa bara n'obodo."" Uru ndị ọzọ egwu ọnwa na-abara ndị gboo bụ: Ndị agaghị apụta egwu ọnwa Ọbụghị onye ọbụla na-aga n'ọgbọ ebe a na egwuri egwu ọnwa BBC Igbo kpọtụkwaara nwaada Celestina Obiejesi, onye kọwara na ọbụghị mmadụ niile na-eso apụ egwu ọnwa. Gịnị chụlara egwu ọnwa? Maazị Okoro kọwara na ụka so na otu ihe chụrụ ọtụtụ omenala ọsọ n'ala Igbo, nke gunyere egwu ọnwa. Mana Okoro kọwara na ụka na omenala bụ otu. Iji maa atụ, ""akwụkwọ nsọ kwuru 'a bụ m ụzọ, eziokwu na ndụ', mana nnanna anyị ha agwala anyị kamgbe gboo na 'eziokwu bụ ndụ'"" Ọzọkwa bụ agụmakwụkwọ nke ndị bekee bụ nke a kpọrọ 'formal education'. ""Ihe ndị a so na ihe melara egwu ọnwa anyị, mana anyị agaghị ahapụ ịkọwara ụmụ anyị ka ha mata etu anyị si mụọ ihe n'oge gboo"" Okoro kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44359284,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44359284,Gọọmenti na-ebido ịna ego e tinyere n'ụtụ mmanya ọkụ na anwụrụ taa,Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ ọhụrụ e tinyere na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ.,"Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse anwụrụ na Naịjirịa Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ iwu tinyere ego n'ụgwọ ụtụ dị n'anwụrụ, mmanya biya, mmanya wain, na mmanya ọkụ e si mba ofesi bubata mana o nyere amara mkpụrụ ụbọchị 90. Nke a na-eso akwụkwọ mịnịsịta okwu ego dị n'aka bụ kemi Adeosun degara onyeisiala Buhari ka o nye iwu ka e bido ya bụ iwu. Adeosun kwuru n'akwụkwọ iwu ahụ na mmegharị iwu ahụ ga-ebido afọ 2018 rue afọ 2020 iji belata mmetụta o nwereike imetụta ngalaba ahụ. Dịka o si kwuo, ajọ ọrịa anwụrụ na mmanya ọkụ na-ebute ga-ebelata site n'iwu ọhụrụ a. Ego e tinyere n'ụtụ a bụ iji kwado iwu ọhụrụ ECOWAS nke a na-ele anya ga-ewelite ego gọọmenti na-enweta ma belata mmebi ya bụ ngwọahịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53222131,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53222131,Igbo Artefacts: Ụfọdụ akpụrakpụ ndị ọcha na-ere bụ nke e zuru n'ohi',"N'agbanyeghị na ọkammụta a ma ama banyere nka bụ Chika Okeke-Agulu na-akpọ oku ka ụlọ ahịa nka Christie's ghara ire akpụrakpụ mụọ abụọ si ala Igbo, ha nwereike ree ha taa.","'Ụfọdụ akpụrakpụ ndị ọcha na-ere bụ nke ezuru n'ori' Ọkammụta Okeke-Agulu gwara BBC na ọ bụ 'ohi' ka e zuru akpụrakpụ abụọ a n'oge agha Biafra. Christie's gọrọ ụkwụ na aka sị na orire ihe ndị ahụ kwụ ọtọ. A na-ele anya na nka ndị a ga-erite ihe si $280,000 ruo $390,000. Nka abụọ bụ osisi ka eji tụọ ha ma bụrụ mụọ nwoke na nwaanyị. Ha nọ dịka ha achọrọ ịnata aja na onyinye. Ọkammụta Chịka Okeke-Agulu Ọkammụta Okeke-Agulu si mahadum Princeton si na ọ bụ n'ụlọ alụsị dị na Anambara steeti ka ndị ọcha na ndị obodo so ha eme si zuru mụọ ndị a. Ọ sị na dịka ọ bu n'oge agha Biafra ka ezuru mụọ ndị a, onweghị ka ọ ga abụ eziokwu na ha nwetere ya n'ụzọ ziri ezi. Ọ kwenyere na nka ndị so n'ihe Igbo jiri bụrụ Igbonke kwesiri ịbụ ihe ga-adịrị ndị na-abịa n'ihu. Jane Ada: Nwaada Igbo ji ịkpụ ụzụ na-egosi ụwa arụsị e jiri mara ndị Igbo Ọ bụ n'elekere otu nke ehihe n'ụbọchị Monday bụ nke 29 n'onwa ka Christie's ga-amalite ire mụọ abụọ. Kedụ ihe Christie's na-ekwu? N'akwụkwọ mgbasaozi ụlọ ahịa nka Christie's wepụtere, ha sị: ""Onweghị oge anyị nwetere kepukepụ ọbula na esi ụzọ ezighi ezi bụbata ihe ndị a."" Dịka ha sị kwuo, ọ bụ otu nwa afọ Frans aha ya bụ Jacques Kerchache, bụ onye na-ebute nka, gotere mụọ abụọ a. Otu n'ime arụsị ahụ a chọrọ ire Christie's sị: ""Onweghị akaebe na ọ bụghị onye obodo nka ndị a so si ebe ahu wepute ha,"" Ha sịkwa na onweghi akaebe na agha na-ada ebe e si bute nka ndị ahụ. Ihe ndị ọkammụta ndị ọzọ n'ekwu Ọkammụta Clifford Nwanna bụ onyeisi ụlọakwụkwọ gburugburu na mahadum Nnamdi Azikiwe sị na ọ ga-arịa ahu ịchọpụta ma ọ bu ohi maobu n'ụzọ kwụ ọtọ ka esi buru mụọ ndị a. ""Ekwesiri ime nchọpụta banyere ya makana ọtụ ihe a na-abụ ihe e goro dịka nka. Ọ bụ onye nwetere ya mbụ ga-ama etu o si nwete ya. N'oge mbụ, onwere ka alụsị agaghị adị ire eburu ya tufuo. Igbo na asị 'ikenga adịghị gị ire, ị waa ya nkụ'. ""Ihe na-ewu bụ ibo ya ndị ọcha, si na ọ bụ ha zuru ha ncha. Mana ụfọdụ bu anyị tufuru ha, ụfọdụ bụ ndị bara ụka na atụfu ha. Onweghi ihe ndi be anyi na-eji ihe ndị a eme."" Ihe Okeke-Agulu ga-eme bụ inyocha akwụkwọ ndị ọcha ji banyere nka ndị a. Onwere ike rere ya o nwete usoro e si ree ha."" Otu n'ime arụsị ahụ a chọrọ ire N'otu aka ahụ, Ọkammụta Ochefu bụ onyeisi mahadum steeti Taraba sị na adịghi eso iwu manyere na ndi ọkammuta banyere nka ga-anọ ebe ọbụla a na-egwu ala na Naijirịa. ""Ihe na-eme bụ na ndi mmadụ - ọkachasị ndị na-arụ ọrụ ụlọ maọbụ ụzọ - ga-egwupute nka ma buru ya ga ree na ofesi. "" Ọ gakwara n'ihu sị na ụdịrị ihe malitere kemgbe ndi ọcha bịara Naịjirịa. ""Ha buru nka na Bini, nke a na-akpọ ""Benin Bronze. Ọ bụ bụ na azụ ka a na-ere nka ndị a mana ugbua a na-erezi ha na ihu ahịa dịka ụlọ nka na ebe ndị ọzọ."" Ọ sị na ọ bụ ndị ọcha nna ha maọbụ nne ha buru nka ndi siir Naịjirịa pụo na irite uru ha ugbua. Ọkammụta Ochefu sị na usoro na-echekwa nka na ihe ndị ọzọ diri obodo maọbụ ofufe mpka adịghị iri ma ncha. Kemgbe mkpu oke agbụru na ngaghari iwe ""Black Lives Matter"" nwuru ọkụ, uche ndị mmadụ na-agazị n'ụdịrị okwu, dịka a na-eche na ọbụghị ụzọ ziri ezi ka eji buru ọtụtụ n'ime nka ndị a. Ihe karịrị mmadụ 2000 ebinyela aka n'okwu n'akpọ ka akagbuo oriri nka abụọ a." afirika-43750809,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43750809,Mmadụ 15 n'ime 112 ụmụakwụkọ Chibok fọrọ ndụ - Salkida,Taa bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Epreelụ ga-eme ya afọ anọ ndị Boko Haram ji tọrọ ụmụnwaanyị ruru 219 n'ụlọakwụkwọ ha n'obodo Chibok dị na Borno steeti.,"Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka Cheta na ndị Boko Haram tọrọla ụmụakwụkwọ a n'afọ 2014 n'ụlọakwụkwọ ha bụ Government Secondary School, Chibok, nke mere ka ụwa niile tinye ọnụ. N'agbanyeghị na ndị Boko Haram nọ na-ewepụta ihe nkiri na-egosi na ha ji ụmụakwụkwọ ahụ, ụfọdụ ndị Naịjirịa ekweghị na-eji ha eji. Onye ntaakụkọ so na ndị gara okwu maka ịhapụ ụmụakwụkwọ mgbe ihe a mere bụ Ahmad Salkida, gbara ama na ọ bụ nanị ụmụagbọghọ iri na ise (15) fọrọ ndụ n'ime mmadụ otu narị na iri an abuo (112) ka nọ n'aka ndị Boko Haram. BBC jụkwara otu n'ime odeakwụkwụ nta akụkọ gọọmenti etiti bụ Garba Shehu ihe o chere maka nke ahụ. N'ọsịsa ya, Shehu zara na ya ""amaghị maka nke ahụ"". Na nso nso a, gọọmentị Naịjirịa wepụtara otu ijeri dọla ha sị na ha ga-eji buso ndị Boko Haram agha. Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ na nabata ọtụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapuru na nwa ya Nwunye osote onyeisiala Naịjirịa nabatara ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ Tupu ụmụakwụkọ a ebido ịpụta n'agbụ n'ụzọ dị icheiche, ma ndị gbafuru agbafu ma ndị eji gbanweta ndị Boko Haram eji eji n'ụlọmkpọrọ, onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau, ziputere ihe nkiri gosiri ka ya na ọtụtụ n'ime ha nọ, iji kparịa gọọmentị Naịjirịa. Ihe nkiri a Abubakar Shekau wepụtara na-egosi ụmụakwụkwọ Chibok ebe ha na-ekpe alakụba Mmadụ ole atọghapụrụla Afọ abụọ gachara tupu ahụ otu n'ime ụmụakwụkwọ a. A na-eche na Boko Haram ka ji ụmụakwụkwọ 113, ebe ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ụfọdụ n'ime ha anwụọla. Nne na nna ụmụakwụkwọ Chibok ka nọ n'agbụ ka na-enwe olileanya na ụmụ ha ga-alọghachitere ha n'udo Kamgbe eji tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok, gọọmentị ọzọ abanyela n'ọkwa ọchịchị na-achọkwa ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ. N'ọnwa Maachị, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa ịgbaghara onye Boko Haram ọbụla ga-echegharị ma chilie aka elu. Onyeisiala Buhari zutere ụmụakwụkwọ Chibok eji gbanwee ndị Boko Haram n'ụlọọrụ ya n'Aso Rock Cheta na atọghapụkwara otu nwata akwụkwọ ọzọ bụ Salomi Pogu, n'ọnwa Jenụwarị 2018. Ụfọdụ ndị ama ama dịka ndị na-eme ihe nkiri na ndị na-agụ egwu tinyere ọnụ n'ịkpọku gọọmentị Naịjirịa ka ha gbaa mbọ hụ na ụmụaka ahụ lọghachitere Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ụmụakwụkwọ a Ụfọdụ ndị na-eru n'okwu na ndị na-akwado ihe gbasara ntọrọ ụmụakwụkwọ Chibok kwuru etu o si metụta ha n'elu Twitter." afirika-44024240,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44024240,Achọtara ozu mmadụ 45 n'obodo Gwaska na Kaduna,Ọ bụ iru uju na anyammiri na-ewu n'obodo Gwaska ebe ndị omekome bu egbe wakporo obodo ahụ dị na Kaduna steeti.,"Ndi mere ihe ahụ gbagburu ụmụaka na ndị okorobia na-agbalị iche obodo ahụ nche Ndị ka dị ndụ ebe ahụ sị na ndị bu egbe si na mpaghara Zamfara mapụta, gbaa obodo gburugburu wee malite ịgba egbe. Ka-akụkọ a na-apụta, achọtala ozu ruru 45 ebe a na-atụ egwu na ozu ndị ọzọ ka nwereike ịdị n'ọhịa. Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ebe ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na ọ bụ ụmụaka na ndị nche bụ ndị mgbọ kachara metụta. N'akwụkwọ ọgbakọ ndị nche na Birnin-Gwari dere, ha dụrụ ndị obodo ahụ ndụmọdụ ka ha saa anya mmiri maka akwamozu ndị nwụrụ anwụ na-abia n'ọdịnihu. Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ a ga-awakpo obodo Birnin Gwari n'ime ụbọchị ole na ole. Akụkọ ga-amasị gị" media-54739824,https://www.bbc.com/igbo/media-54739824,Patrick Chuka na-eji mkpịsị odee ese ihe akọwaala etu o si malite,Patrick Chuka bụ nwaamadị na-eji mkpịsị odee ese ihe.,"Chuka dị afọ 20 gwara BBC Igbo na ọ bụ ya ji aka ya kuziere onwe ya etu e si eji mkpịsị odee ese ihe. Chuka bi na mba Amerịka ugbua, kwukwara na ise ihe bụ akaraka ya. O kwuru na otu ihe na-enyetu ya nsogbu n'ọrụ a, bụ ịhụ ndị ga-agba ya aka ahịa. Mana nke a egbochighi ya inye ndị ntorobia ibe ya na-eme nka ndụmọdụ, ebe ọ gwara ha ka ha gbasie mbọ ike ma na-achụsi nrọ ha ike. Gere ihe o kwuru n'uju: Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Chiemela Peter Mgbeahuru" egwuregwu-50796702,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50796702,Chelsea v Bournemouth: Bournemouth akụnyela Chelsea ikputu ọnụ,A ka nwereike ịzọpụta otu Chelsea na izu Premier League a?,Ọ bụ ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka otu Bournemouth mere ka ala meghe ọnụ loo ha bụ Chelsea mgbe ha zutere onwe ha. Ihe bụ isi sekpụ ntị n'okwu bụ goolu Gosling nyere na nkeji 84 dịka asọmpị ahụ na-erute na njedebe. Hudson-Odoi nwara ịsachachi ọkpụ ahụ ugboro abụọ na nkeji 90 mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ihe kachasị wute Chelsea na mmeri a bụ na e meriri ha na be ha bụ Stamford Bridge. Chelsea na-enwe olileanya na ha ga-abanye n'otu iri na isii ikpeazụ. Otu Tottenham na-echezi ha n'ihu ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị afirika-50104868,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50104868,Enugu State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Enugu State,A ma Enugwu Steeti ama dịka isi obodo mpaghara ọwụwa anyanwụ Niajiria.,"Coal Otu ihe akụ ọnatarachi e ji mara Enugwu bụ 'coal'. N'oge mbụ 'coal' nke e si n'Enugwu egwupụta so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego. Mana ọbụghị sọ 'coal' bụ ihe akụ ọnatarachi dị n'Enugwu. Lee ndị ọzọ dịka ngalaba dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta. 1) Coal 'Coal' Coal bụ unyi pụrụ iche e si' nala egwupụta. E ji ya emepụta ọkụ latrik, jirikwa ya akwọ ụgbọ okporoigwe Bekee kpọrọ 'train'. 'Coal' bụ ihe e ji mara Enugwu steeti, nke mere e ji akpọ ya 'Coal city'. N'Enugwu North na South ka 'Coal bara ụba. 2) Gypsum Ọgba ebe 'gypsum' jupụtara Gypsum bụ ụdị nkume dị nro e si n'ala egwupụta. Ọ naghị esicha ike ka nkume ndị ọzọ. Ihe e ji ya arụpụta dị ụbara. Ha gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP). E jikwa ya eme ka ala dị mma maka ịkọ ihe. Na mpaghara Ezeagu ka e nwere 'gypsum' nke ọma. 3) Iron-Ore Ọbụ 'Iron ore' ka e ji arụpụta rọọdụ e ji arụ ụlọ 'Iron ore' bụ ihe dị ka nkume e si n'ala egwuputa nke e ji emepụta igwe na ihe ndị ọzọ. Ọbụ 'Iron ore' ka e ji arụpụta rọọdụ e ji arụ ụlọ nakwa igwe e ji arụ akwa mmiri nke Bekee kpọrọ 'steel'. Onye gaa na akụkụ Udi, Igboeze North nakwa South, ebe ahụ ka 'Iron ore' jupụtara. 4) Glass Sand Ikwaiko na nwaanyị nọ na nsọ ya anaghị aba Ọgba Ezeagu Nke a bụ aja pụrụ iche nke e nwere ike ịgbaze iji mepụta 'glass'. Ihe e ji 'glass' arụpụta karịrị akarị. Nke a mere ka 'glass sand' bụrụ akụ ọnatarachi pụrụ iche. Na Udi nakwa Uzo-Uwanị ka ị ga-ahụ 'glass sand' n'uju. 5) Silica Sand 'Silica Sand' 'Silica sand' bụ aja pụrụ iche na-egbuke egbuke nke e ji eme ka ụlọ sie ike. O sokwa na akụrụngwa e ji emepụta 'cement'. Ahịa 'silica sand' na mba ụwa niile ruru ijeri dọla asaa na ụma anọ n'afọ 2018. A na-atụ anya na ọ ga-eru ijeri dọla iri na ụma ise n'afọ 2024. Ebe a ga-ahụ 'silica sand' bụ na Enugwu South, Igboeze North na South na Isiuzo. 6) Laterite E ji laterite arụ ụzọ Ihe e ji 'laterite' emepụta dị ọtụtụ. Ha gụnyere ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. Na mpaghara Awgu, na Igboeze North na South ka e nwere 'laterite' kasị mma n'Enugwu. 7) Pyrite Pyrite 'Pyrite' bụ igwe na-egbuke egbuke. Ndị ọkacha mara na-ekwu na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdịkwa ebe ahụ. Ọbụkwa kịrịkịrị ọlaedo ahụ na-adị n'ime 'pyrite' mere o ji ada oke ọnụ ahịa. E ji ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, naọla ndị ọzọ e ji acọ mma. 'Pyrite' dị nke ọma na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu South. 8) 'Ball Clay' Ụdị aja ụrọ a na-ama mma n'anya n'ihi ọcha ya. 'Ball clay' bụkwa otu akụrụngwa e ji emepụta 'ceramics'. Mpaghara e nwere 'ball clay' nke ọma bụ na okpuru ọchịchị Isi Uzo. 9) Copper 'Copper' 'Copper' bụ ụdị igwe pụrụ iche. A na-agụkọ ọla edo, ọla ọcha na 'copper' ọnụ. Uru 'copper' bara dị ọtụtụ. Agwakọọ 'copper' na 'aluminium' maọbụ 'zinc', ihe a ga-enweta bụ 'bronze'. Nkanu East na West bụ ebe e nwere 'copper'. 10) Ndị ọzọ Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo Enugwu bụkwa obodo na-emepụta nri nke ọma. Ha nwekwara ihe nlere anya dị iche iche dịka ọgba, ugwu, ọdịda mmiri nke Bekee kpọrọ 'water fall'. N'otu aka ahụ kwa, mmepụta ejije bụkwa ihe ọzọ e ji mara Enugwu. Ọbụ ebe ahụ ka a na-anọ emepụta ọtụtụ ihe ejije 'Nollywood'. Ọ bụrụ na gọọmentị etit nakwa nke steeti elebaa ihe ndị a anya, Enugwu ga-abụ ụwa bịa lelee. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''" media-47195885,https://www.bbc.com/igbo/media-47195885,Nigeria Election 2019:: Ntuliaka ga-aga n'Anambara dịka e siri hiwe ya - Inec,"Inec ekwuola na agbanyeghị ọkụ gbara ụlọrụ ha na Anamara steeti, ntulliaka ga-aga dịka e siri kwado ya na steeti ahụ.","Ọkụ amaghị ebe osi gbapịala ụlọọrụ Inec dị n'Ọka, Anambara Steeti ụbọchị Tuzde. Dika ozi Inec wepụta nke Onye Kọmịshọna ha na-ahụ maka mgbasaozi bụ Festus Okoye binyere aka kwuru, otụtụ ngwaọrụ ha nke gụnyere 'Card Reader' dị pụkụ anọ, narị isii na iri itoolu na ise so na ihe ọkụ ahụ repịara. ""N'agbanyeghị ndọghachi azụ ọdachie wetara na nknjikere anyị maka ntuliaka n'Anambara steeti, ụlọọrụ anyị gbalịrị nweta 'card reader' ndị etinyeghị nọ ọrụ na steeti ndị ọzọ a ga-eziga Anambara."" End of Twitter post, 1 ""Nke a nyere anyị ọkịka obi na ntuliaka ga-aga n'Anambara dịka e siri kwado ya."" Okoye kọwara na ọdachi nke Anambara bụ nke atọ ya n'ime abali iri na abụọ dịka ọkụ gbara ụlọọrụ ha dị na Isiala Ngwa, Abia steeti nakwa Opuru ọchịchị Qua'an Pan dị na Platu steeti. Ọ gara n'ihu kwuo na ha ewegarala ndị uweojii na ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ ozi, ndị maliterela nyocha. N'Imo Otu ndịagha Naijiria nke 134 Artillery regiment di n'Obinze na steeti Imo, anwuchiela umuokorobia ano bu ndi Soja adigboroja. Ha kọwara ndi a dika ndi ori nọ n'Owere, gbakwunye na ha na-emenyụ ndị mmadu anya kemgbe. Na mba ofesi Otu onye anwụọla n'ọgbaghara sọ ndọrọndrọ ọchịchị na mba Senegal dịka ha na-akwado ime ntuliaka ọkwa onyeisiala. Ọ bụ ndị na-akwado Onyeisiala Macky Sall na onye na-azọ oche ya bụ Issa Sall malitere nsogbu a. N'egwuregwu, Otu Flying Eagles nke Naịjirịa anarala ngalaba CAF ikike iyi mgbaaka ojii iji kwanyere Taiwo Ogbunjobi ugwu dịka ha na-akwado izute mba Mali n'asọmpị iko mba Afrịka. Taiwo Ogbunjobi, onye bụbu odeakwụkwọ ukwu otu NFF nwụrụ ụbọchị Monde ka ọ rịachara ahụ obere oge. Asup akwụsịla abụbọọrụ Otu jikọrọ ndị nkuzi politekni bụ Asup n'aha ịchafụ akwụsịla abụbọọrụ ha gbara kemgbe ọnwa abụọ. Asup gbara abụbọ ọrụ kemgbe ọnwa Disemba afọ 2018 iji gosi iwe gbasara emezughị nkwekọrịta ha na gọọmenti etiti nke afọ 2009 nakwa nke 2017; akwụghị ha ụgwọ kwesịrị ha, ịta ụfọdụ ndị otu ha ahụhụ nakwa ihe ndị ọzọ. Clinton sị na ya agaghịkwa abịa Naijiria dịka ọkwadoburu Aka chiburu mba Amerịka bụ Bill Clinton akagbuola njem ya ịbịa Naịjirịa nke Otu National Peace Accord zigara ya akwụkwọ ka ọ bịa hụrụ ka mbinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta udo ga-esi gaa. Cheta na akara na ọ ga-ekwupute okwu n´ụbọchị a ga-ebinye aka n'akwụkwọ bụ ụbọchị Febrụwarị iri na abụọ na iri na atọ. Akwụkwọ ozi, ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Angel Ureña zigara ụlọọrụ Thisday kwuru na ya bụ njem aghaghị ịnwe ntụpọ ndọrọndọrọ ọchịchị. ""Nke a mere na Clinton agaghị abịalị ọgbakọ a."" N'Anambra, Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos Ụgbọala bu mmanụ ụgbọala agbala ọkụ n'okporoụzọ gawara Nnewi Okigwe dị n'Anambra steeti. Onyeisioche ụlọ ebe a na-agbapụta mmanụ ụgbọala bụ Patrick Okeke kwuru na o nweghị onye nwụrụ n'ọkụ a gbaranụ. Nke a na-eme ka akụkọ pụtachara abali abụọ gara aga na mmadụ asaa nwụrụ n'ọkụọgbụgba tanka mere n'Awka. Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrats na Repọblikan na mba Amerika ekwekọrịtala iwepụta ego a ga-eji rụ agada jikọtara ha na mba ndị ọzọ ka ha gbochie mmechi gọọmenti mba Amerịka nke ọzọ. N'Egwuregwu Onye otu egqwuregwu Arsenal ama ama bụ Aaron Ramsey ebinyela aka n'akwụkwọ n'ọrụ ngo ruru pounds narị anọ kwa izu ụka maka ịbanye otu egwuregwu Juventus. Ọ nọọla ruo afọ iri na otu n'otu egwuregwu Arsenal. Nkeji Taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a." afirika-44017199,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44017199,Ntuliaka ime ụlọ APC ataala isi mmadụ abụọ,"Ogbaghara pụtara na ntuliaka ime ụlọ APC mere eriele isi mmadụ abụọ, otu na Legos nke ọzọ na Delta steeti.","Ndị nọ ebe e mere ntuliaka ahụ n'Ekiti Akụkọ ka na-apụta maka onye nwụrụ na Legos ebe otu nwoke bụ Jeremiah Ojeveta n'azọ ọkwa Chairman na Delta nwụrụ site n'ọgbaaghara taa. A kagbukwara ntuliaka nke APC mere n'Ekiti maka iji wepụta onye ga-anọchite anya ha n'ọzịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ọnwa Julai. Akụkọ so ntuliaka a bụ na ọgbaaghara dapụtara dịka ndị omekome ji egbe dabatara n'ebe ahụ, ebe ụfọdụ mmadụ na-alụ ọgụ. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Cable siri kọwa, ụfọdụ ndị n'azọ ọkwa nnọchite anya a n'ime otu APC were iwe si n'ebe a na-eme ntuliaka pụọ, dịka kọmitii chịkọtara ntuliaka ahụ na-ekwu na o nweghi onye meriri. Otu APC mere ntuliaka imeụlọ na mpaghara dị icheiche na Satọde maka ịhọpụta ndị ga-achị wọọdụ ga n'ala Naịjirịa. Kọmiti na-achịkọta emume a na ndị niile na-azọ ọkwa ahụ kwekọrịtara n'ime onwe ha ịkagbu ntuliaka a. Ọ fọdụrụ ka ebugharịa ụbọchị ntuliaka a maka oke mmiri zoro n'ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53357259,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53357259,Igbo Tradition: Ihe isii nwere ike ịnọchị anya ọjị n'omenala Igbo,Otu n'ime ihe ndị e ji mara ndị Igbo bụ ịnabata ndị ọbịa nke ọma.,"Onye ị bịara ya be ya ma onyeghị gị ọjị, bilie laa N'omenala Igbo, inye onye ọbịa ọjị bụ ụzọ pụtara ihe na mmadụ ji obi ọcha ya nabata onye ọbịa ahụ na be ya. Okenye ọbụla bụ nwoke anaghị ekwe ka ọjị kọlahụ ya n'ụlọ, maka na mberede nyịrị dike mana mberede ka e ji ama dike. Mana mgbe ụfọdụ, anaghị ama ama, ọjị nwere ike ịkọ mmadụ mgbe onye ọbịa bịakwutere ya, n'oge dị otu a, gịnị ka ọ ga-eme? O nwere ihe ụfọdụ omenala Igbo nabatara mmadụ nwere ike iji meere ọbịa ya ọjị ma ọ bụrụ na mkpụrụ ọjị adịghị. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: 1) Mkpụrụ osisi yiri ọjị Mkpụrụ aṅara nwereike ịnọchi anya ọjị E nwere mkpụrụ osisi ndị ọzọ e nwere ike iji mee ọjị ma ọ bụrụ mkpụrụ ọjị adịghị. Ha gụnyere: 2) Nzu Nzu na uhie na-egosi obia ọcha e ji nabata onye ọbịa Nzu bụ otu ihe a na-akwanyere ugwu n'omenala Igbo. Maka na ọ na-acha ọcha, ọ na-egosipụta ihe dị ọcha. Inye onye ọbịa nzu ka ọ tụọ n'aka na ụkwụ ya, ma kakwaa n'ala, na-egosi na mmadụ ji obi ọcha ya niile nabata onye ọbịa ahụ. 3) Mmanya E nwereike iji mmanya ọkụ meere onye ọbịa ọjị N'omenala Igbo ọ bụrụ na mkpụrụ ọjị adịghị nso, mmanya nwere ike ịrụ ọrụ dịka ọjị. Mmanya nkwụ, ngwọ maọbụ mmanya ọkụ ọbụla ka a na-ejikarị eme ọjị. Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus Mana n'oge ugbua, ụfọdụ ndị okpukperechi Kraịst anaghị ekwe aṅụ mmanya na-aba n'anya. Ndị dị otu a, e nwere ike iji mmanya ọtọ bịrịbịrị meere ha ọjị. 4) Mmiri Otu iko mmiri e nyere onye ọbịa na-egosi nnabata N'oge gboo, ọ bụ ụkwụ ka e ji eme njem niile, ya mere na onye si ebe dị anya, akpịrị ga na-akpọ ya nkụ. Ọ bụrụ na mmadụ si ebe dị anya chọta mmadụ, ihe mbụ a na-enye ya bụ mmiri ka o wee butuo akpịrị ya. A ga-ekunyekwa ya mmiri ka o were sachaa ụkwụ ya ruru unyi. Ọ bụrụ na onye ọ bịakwutere enweghị mkpụrụ ọjị n'ụlọ, mmiri ahụ o kunyere ya egosila na ọ ji obi ọcha nabata ya. N'oge ugbua kwa, ọ bụrụ na mmadụ achọghị ịta ọjị maọbụ ịṅụ mmanya, ọ ga-arịọ ka e kunye ya mmiri iji gosi na obi ya dị ọcha. Ọ bụ nnukwu ihe ọjọọ mmadụ ịbịa be mmadụ jụ ịṅụ kama mmiri nkịtị. 5) Nri Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị N'obodo ụfọdụ n'ala Igbo, ihe dịka abacha, akịdị, na ndị ọzọ bụ ọjị ka e ji ha eme. Ha bụ ihe a na-ebutere onye ọbịa iji sị ya nnọọ, o zutụ ike, e butezie nke bụ nri. Na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu nakwa Abịa steeti ka a na-eme ụdị omenala a. 6) Ego/Ihe onyinye Oge ụfọdụ, a na-enye onye ọbịa ego ma kwuo ihe dịka ""nwannem ka anyị were nke a mee ọjị"" Onye Igbo anaghị ajụ ego ajụ. Ndị na-ejikarị ego eme ọjị bụ ndị ọgaranya. Mana ọbụghị ya ga-abụ ihe mbụ ọ ga-eche ndị ọbịa ya n'ihu. N'oge gboo, ọ bụ ego ayoro ka ha ji eme ihe Ọ na-abụkarị onye ọbịa lawa ka i nwereike nye ya ego ma sị ya ""nwannem ka anyị were nke a mee ọjị"". Ụfọdụ nwere ike ịnwunye onye ọbịa ha ọkụkọ maọbụ kpụnye ya ewu, iji cheere ha ọjị. 7) Ire ọma Okwu ọma dịka ""biko akọla m ọnụ ọjị"" nwekwara ike ịrụ ọrụ dịka ọjị Ndị Igbo sị na ọ bụ ire ọma ka ejula ji aga n'ogwu. Ọ bụrụ na mmadụ enweghi mkpụrụ ọjị, onye ahụ nwereike iji ihu ọma na ire ọma gbara onwe ya. E nwere ilu na akpaalaokwu dị icheiche mmadụ ga-eji mee nke a. Okwu dịka ""biko akọla m ọnụ ọjị"", maọbụ ọ bụrụ na mgbede abalị ka onye ọbịa ahụ bịara, a ga-asị na ""abalị ewerela ọjị"". Etu ọbụla o sila dị, ezigbo nwaafọ Igbo ga-achọrịrị ọjị nye ọbịa ya. Emeghi otu a, ọ na-egosi ụzọ ihe abụọ: N'aka nke ọzọ, onye ọbịa agaghị ajụ ịnara ọjị na nke onye ọ biakwutere. Agbanyeghi ma ije ahụ ọ bụ ije ọma ka ọ bụ ije mwute, a ga-atarịrị ọjị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47292317,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47292317,Election rigging: Ụzọ asaa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka,"Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ọkụ ka ndị uweojii na ndị agha, ghara imere onye ọbụla a nwụchiri ka ọ na-anapụ igbe vootu na ntuliaka na-abịa ebere.","Mana ị ma na ọ bụghị naanị izu igbe vootu bụ ụzọ e si eme mago-mago na ntuliaka? Lee ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka onyeisi na-ahụ maka ọchịchị obodo n'ụlọọrụ 'ActionaidNigeria' bụ Celestine Odo na osote onyeisioche 'Situation Room' bụ Ọkaiwu Esther Uzoma, kwuru bụ ụzọ ndị ọzọ: 1.Ịnapụ igbe vootu atụrụ atụ Ịnapụ igbe vootu atụrụ atụ bụ otu ụzọ were anya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji atụgharị ihe ndị mmadụ tụrụ na vootu. Iwu Naijiria dịka o siri gbasa ntuliaka, kwuru na onye dara iwu izu igbe vootu ga-aga mkpọrọ ọnwa iri abụọ na anọ. 2.Igo vootu Ire maọbụ zụọ vootu Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ego n'aka, n'aka, maọbụ tinye ya n'akpa ego ndị mmadụ iji zụọ vootu ha. Celestine Odo kwuru na ""ike ego na-abịa n'ụdị dị iche iche; O nwere nke bụ ịnara ndị mmadụ akara ụlọakụ na-etinyere ha ego."" 3. Ikesa ihe onyinye Ewezuga ego, ha na-enye ndị mmadụ onyinye dịka akwa, okpu, osikapa, nnu, mkpaọkụ, iji goro obi ha ma mee ka ndị ahụ kwe tụnyere ha vootu. 4.Idegharị ihe e dere A ka na-eme ọtụtụ ihe gbasara ntuliaka dịka mgbe ochie, nke mere na a na-edepụta mpụtara n'akwụkwọ. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ụfọdụ ndịọrụ Inec na-akpa nkata degaharịa ihe ederala n'akwụkwọ mpụtara ntuliaka na wọọdụ, site n'iwere akwụkwọ mpụtara adịgboroja dochie nke ezigbo bụ ngụkọ ihe ndị mmadụ tụkọtara. 5.Ibi akwụkwọ ntuliaka adịgboroja Ibi akwụkwọ ntuliaka adịgboroja so n'ụzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka. Izu gara aga, akwụkwọ akụkọ kwuru na ndị uweojii nwụchiri mmadụ abụọ bu akpa akwụkwọ ntuliaka dị iri na anọ na Kano. 6.Ime ihe iyi egwu, ọgbaghara Agwa ndị uweojii na-akpasa ndị mmadụ nwere itinye egwu mee ka ụfọdụ ghara ịpụta mee ntuliaka Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eziga ndị agboro, ndị na-aga eyi ndị chọrọ ịtụ vootu egwu nke bụ na egwu anaghị ekwe ụfọdụ pụta tụọ vootu. Ụfọdụ na-eyi egwu site n'ikpoju ndị ọrụ nchekwa dịka ndị agha na ndị uweojii n'ebe a na-eme ntuliaka dịka e mere n'Ekiti na Ọshụn steeti na nso nso a. 7. Ntọ/ịgbagbu onye ike n'obodo Ụzọ ọzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru bụ ị tọrọ maọbụ igbu onye nwere agba ha mara na ndị mmadụ na-ege ntị n'okwu ya. Ọkaiwu Esther Uzoma kọwara na e nwere ike ịkpachi onye nwere agba ""ka ha ghara ịma etu e siri tụọ vootu."" Ụzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka Na nso nso, e gburu onye nnyemaka Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti n'ihe gbasara ndị ntorobịa bụ Lawrence Ngozi, nakwa onyeisioche APC n'Ohimini na Benue steeti. Ọtụtụ ndị nwere agba egburula maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria gụnyere Marshal Harry, onye bụbu osote onyeisioche otu pati All Nigeria People's Party (2003); Bola Ige, onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ikpe(2001) nakwa Funsho Williams, onye zọburu ọkwa Gọvanọ Legọs steeti n'okpuru PDP (2006). Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43410252,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43410252,'Anyị na-achọ ụmụụnụ'- Buhari,Onyeisiala Mohammadu Buhari agwaala ndị Yobe steeti na ihe emere ojiri ga steeti ha bụ maka ị gwa ndị nne na nna ndị agha iyiegwu tọọrọ umu ha ndo.,"Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram? Buhari kwuru na kemgbe ihe a mere, ha na-agba mbọ ị hụ na achọtara ndị ụmụakụkwọ a sị ụlọakwụkwọ akpọrọ Government Girls Science and Technical College na bekee n'ime Dapchi, Yobe steeti. O kwukwara na ọ nyeela onyeisi ndị uweojii na ndị isi otu nche di ịcheịche iwu ị me ihe niile ha nwereike ị me maka ịzọpụta ụmụawụkwọ a. Buhari kwuru na ""ndị agha ala anyi na-achọ ụmụakwụkwọ a n'ime ọhịa dị na mpaghara ugwu Naịjirịa"" O kwukwara na ndị aghaelu na-enyocha yabụ ala, na gwa kwa ndị nne na nna ndị ha tọọrọ ihe niile ha mara gbasara ịzọpụta ha. Buhuri kwere ha nkwa na kọmitee iri na abụọ ebidoola ọrụ maka ihe nzọputa ụmụakwụkwọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53808498,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53808498,Ndị Naịjirịa anyị gbachiri ọdọ ahịa ha dara iwu ala anyị - Gọọmentị Ghana,"Onyeisi mgbasaozi na ngalaba na-ahụ maka ịtụ mgbere na Gana bụ Prince Boakye Boateng ekwuola na ihe mere ha ji na-agbachi ọdọahịa ndị Naịjirịa na mba ahụ bụ makana iwu ha machiri ndị ofesi ịtu mgbere n'otu n'otu nke Bekee kpọrọ ""retail"".","Okwu Prince Boateng a na-abịa dịka ndị ofesi na mba ahụ - ọkachasị ndị Naịjirịa - na-eti mkpu na ndị na-arụrụ gọọmentị Gana ọrụ na-agagharị agbachisi ọdọ ahịa ha. N'ụbọchị Satọde Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi ""Nigerian Union of Traders Association"" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - gwara BBC na ndị ọrụ gọọmentị Gana na-agagharị na-agbachị ụlọ ọrụ ha. Ọ sị na ihe a tinyere ọtụtụ mmadụ na gbagharịa. ""Ndị Naịjirịa nọ na Ghana ugbua na-ekwu na ọnọdụ ha bụzị kwara lawa, kwara lawa dịka gọọmnetị mba ahụ malitere njem a ọzọ."" Kizito sị na ndị Naịjirịa nọ na Gana na-ahụ ihe a na-eme dịka mmegide, ọkachasị ebe o si metụta ị gwa ha ka ha ghara ịtụ mgbere na ahịa nakwa ịsị ha dewe otu nde dọla tupu ha amalite ịzụ ahịa. ""Ọbụghị sọsọ idowe otu nde dọla bụ nsogbu. Nke ka nke bụ ịsị anyị ghara ịtụ mgbere n'ahịa. Nke a pụtara na anyị nwee otu nde dọla, anyi agawa n'ime ọhịa ga hibe ọdọ ahịa."" ""Onye ga-abịa zụọ anyị ahịa ma ọ bụụ na anyị anọghị n'ahịa?"" Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnụdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana 'Rụwanu Naịjirịa Mall na Ghana' Mana, Prince Boateng sị na ọ bụ iwu Gana ka ha na-eso dịka iwu ahụ kwuru ka ndị abụghị ndi Gana ghara ịre ahịa n'ime ahịa. Ọ sị; ""Anyị nwere Shoprite, nwee China Mall. Onweghi ihe gbochiri ndị Naịjirịa maọbu ndị mba ọzọ nọ Gana ịga rụọ ọdọ ahịa ma kpọọ ya ""Nigeria Mall"", maọbụ ""Senegal Mall"". Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọbụghị ndị Naịjirịa ka e ji maka ha wepụta atụmatụ a, mana ọ sị na bụ ndị Naịjirịa ka ọ kachasị emetụta. Okwu Kizito Obiora maka nsogbu ndị Naịjirịa na-enwe n'ahịa Ghana O kwuru sị: ""Ihe anyị na-ele anya bụ ma edenyela aha ọdọ ahịa ahụ n'akwụkwọ gọọmentị."" ""Ọzọ bụ ịma ma ụlọọrụ ahụ o nwere akaebe na ọ na-akwụ ụtụ isi."" ""Ọzọkwa bụ ma ngalaba a na-akpọ ""Ghana Standards Authority"" o kwuola ma ihe ụlọọrụ ahụ na-ere ọ bu ihe ziri ezi."" Mana Maazị Obiora sị na atụmatụ ndị a niile bụ usoro ndị Gana jiri chọọ ịchụ ndị Naịjirịa na mba ahụ, nke mere o ji jụọ: ""mmadụ ole nwere otu nde dọla ha ga-eji tuọ mgbere na Gana?"" Ndị Naịjirịa ga-ala Obiora si na ihe ga-echere ha ma ya bụrụ na okwu a ekweghị okwukwu bụ gọọmentị Naịjirịa ị bịa buru ndị Naịjirịa no Gana laa. Mana Prince Boateng sị na otu nde dọla a na-ekwu okwu ya abụghị ka ndị Naịjirịa nye ha ego a. Ọ sị: ""ego a abụghị Gana ka ha na-enye ya, kama ọ bụ ego iwu sị na onye ọbụla si ofesi ga-etinyeriri na ụlọọru ya ma ya chọrọ ịtụ mgbere na Gana."" Maazi Obiora sị na ọ bụghi sọso nke a bụ isi okwu. Ọ sị, ""Iwu ha a sịkwa na anyị ga-ewe ndị Gana mmadụ 25 n'ọrụ."" Ọ bụghịzị ndị Gana na-azụ ahịa na-achụ ndị Naịjirịa Obiora sị na ọbụghị ndị a kpọrọ Association of Ghana Traders na-achụ ha ugbua. Ọ sị: ""Ọ bụ gọọmentị na eme nke a ugbua."" Maazi Boateng kwenyere na nke ahụ. Ọ sị na oge ndị ahịa Gana gbachiri ọdọ ahịa n'afọ gara aga, gọọmentị gwara ha gaa gbapee ha. ""Otu ndị Gana na-azụ ahịa mere ihe gọọmentị kwuru, mana ndị Naịjirịa emeghị ihe a sị ha mee kemgbe ahụ. O bụ nke a butere ihe a gọọmentị na-eme ugbua."" Otu onye na-azụ ahịa n'obodo Akra ihe a metụtara gwara BBC na ya amaghị ebe ya ga-aga aga makana ya tinyere ihe niile ya nwere n'ahịa ha. Ọ jụrụ: ""Kedụ ebe mmadu dị ka mụ ga-enwete otu nde dọla a ha si anyị wete?"" Abdulaziz Ibrahim bụ onyeisi ngalaba na-anọchite anya Naijirịa na Ghana gwara BBC na ha na ndị mba ahụ na-akparịta ụka banyere okwu a. Ọ sị: ""Naịjirịa na Ghana na-emekọ ọfụma. Anyị ga-ahazi okwu nso nso a.""" afirika-45229360,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45229360,Umar Ganduje abụrụla 'agụ na-eche mba' n'ala Igbo,Umar Ganduje abụr ụ ola 'a g ụ na -ec he mba ' n' ala Igbo,"Eze Eberechi Dick bụ onyeisi otu ndị eze si ọwụwa-anyanwụ etuola gọvanọ Kano steetị bụ Abdullahi Umar Ganduje ugo dika 'agụ na-eche mba 1' nke Ndị Igbo. Otu a kwuru na ha turu Ganduje makana ọ gbara mbọ hụ na ndị Igbo na ndị be ya bi na Kano na-ebi n'udo. Idemmiri egbuola ọtụtụ mmadụ n'India Na mba ofesi, akwa adaala n'obodo Kerela n'ala India ebe nnukwu ide mmiri gburu mmadụ nari atọ na iri abụọ na anọ. Ugbua ndị gbata gbata na-anwa ịzọ ndụ ndị ọzọ biri n'obodo ahụ. Ugbua mmadụ karịrị puku narị abụọ ka idemmiri a chụpụrụ. Ntuliaka 2019 dị n'aka ndị Naịjirịa - INEC Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ntuliaka Naijiria ga-eme n'afọ 2019, ga-aga nke ọma ma ọ bụrụ na onye ọbụla jikọtara aka rụọ ọrụ ọfụma mgbe oge ahụ ga-abịa. Emeka Ononamadu bụ onyeisi ụlọọrụ INEC kwusiri ike na ụlọọrụ INEC niile n'ala Naịjirịa dị njikere ịza ajujụ onyeọbụla nwere ugbua gbasara ntuliaka na-abịa. Ụlọ dara na Jabi egbuola mmadụ abụọ Mmadụ abụọ anwụọla, ebe a na-achọ ihe ruru mmadụ iri ka ụlọ elụ dachara na Jabi dị n'Abuja. Akụkọ na-ekwu na ụmụaka na ndị na-ere nri so na ndị ka nọ n'okpuru ụlọ a dara ada. Kevin de Bruyne ga-eji ọnwa atọ pụọ n'asọmpị niile N'egwuregwu, Kevin de Bruyne onye otu Manchester City agaghị eso n'asọmpị ọbụla ruo ọnwa atọ maka ahụ o meruru n'ụkwụ. Gee akụkọ anyị nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị" egwuregwu-52216126,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-52216126,Treasury House Fire: Isi ụlọọrụ 'accountant general' Naịjiria na-agba ọkụ,Isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego Naịjirịa bekee kpọrọ 'Accountant General' agbaala ọkụ.,"Amabeghi ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba Aha ọzọ a na-akpọ ụlọọrụ ahụ bụ 'Treasury House'. End of Twitter post, 1 Ọkụ ọgbụgba a malitere n'ụtụtụ Wenezde mana amabeghi ihe kpatara ya maọbụ ebe o si malite. Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbara mbọ ọtụtụ awa tupu ha agbanyụọ ya bụ ọkụ. Agbanyụọla ọkụ ahụ ugbua Mịnịsta nta na-ahụ maka bọọjeti bụ Clem Agba ekwuola na onweghi ihe ọbụla dị mkpa mebiri n'ọkụ ọgbụgba ahụ. Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ha akpagharịala n'ebe ahụ ọkụ gbara mana ọ baghị n'ebe a na-edebe ihe dị mkpa. Clem Agba bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka bọọjetị O kwuru sị: ""O nwgeghi ihe mebiri. Naanị ụmụ kịrịkịrị akwụkwọ gbara ọkụ, mana akwụkwọ ego niile anyị niile enweghị nke ọkụ metụrụ."" ""Anyi ga-eleba anya ịmata ihe kpatara ọkụ ahụ. Obi dịkwa anyị ụtọ na onweghi onye nwụrụ na ya."" Bernie Sanders awụsala ọwa ịzọ ọkwa onyeisiala Amerịka Bernie Sanders Onye omeiwu mba Amerịka bụ Bernie Sanders ekwuola na ya agaghịzị eso azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ. Ndị enyemaka Sanders kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha zipuru n'ehihie Wenezde. Sanders, onye dị afọ iri asaa na asatọ, zọbukwara ọkwa onyeisiala Amerịka n'afọ 2016 ma kụọ afọ n'ala. Onye ọbụla na-elezi anya na ọ bụ Joe Biden ga-emeri ntuliaka nke ndị pati 'Democrats' iji gaa ịma Donald Trump aka n'ihu na ntuliaka nke a ga-eme n'ọnwa Nọvemba afọ 2020." afirika-47944815,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47944815,Endsars: 'Mụgharịanụ etu esi e bu egbe',Isiokwu kachasị mkpa na njem onyeisi ndi uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu na Legọs bụ iwu o nyere ka ndị uweojii niile mụgharịa usoro ha ji ebu egbe.,"O kwuru nke a ka ọ na-ezi ndị uweojii ozi na ụlọakwụkwọ ndị uweojii nke dị n'Ikeja na Legọs. O zute kwara ndị nọchitere anya ezinaụlọ Jessy Gold bụ nwata nwaanyị nwụrụ n'aka ndị uweojii na Legọs. O ji ohere ahụ zie ha ozi itiakanobi gbasara ọnwụ nwa agbọghọ ahụ ebe ma kwuo na ozuola bụ na ozuola. Adamu kwukwara na ngalaba ndị uweojii agaghị anabata mmehie ọbụla n'aka ndị uweojii nọ n'okpuru ha. Otu ọkaiwu bụ Obuesi Phillips nọchitere anya ezinaụlọ nwaada nwụrụ kelere onyeisi ndị uweojii maka okwu ya. Ọ rịọrọ ya biko hụ na-emezuru iwu ya n'abụghị okwu a ga-ekpofu ma ọ tụgharịa azụ. Tupu ọ laghachi Abuja, ọ gakwara nleta nkwanye ugwu n'ụlọọrụ Gọvanọ Legọs bụ Akinwumni Ambode." afirika-54614444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54614444,"Oke Obi-Enadhuze: Ụwa na-akwa arịrị maka ọnwụ ya, mana onye ka ọ bụ?",Ọyị nwaanyị Oke Obi-Enadhuze bụ derinmama arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha tụkọta ego nye ndị bee ọyị ya nwoke makana ndị omekome lara ngwogwo niile ha ji biri n'iyi.,"End of Twitter post, 1 Nke a mere ka a malite tụkọtabara ezinulọ Oke ego na GofundMe. Ego ahụ eruola pound 7,859 ugbua. Cheta na ndị ntoroọbịa Naịjirịa nakwa ụfọdụ ndị mba ụwa ka na-akwa arịrị maka ọnwụ Oke Obi-Enadhuze n'elu soshal midia. Oke Obi Enadhuze bụ nwamadị akụkọ kwụrụ na ọ nwụrụ ka ọgbaghara ogbugbu ndị na-eme ngaghariwe na Lekki toll gate n'ụbọchị Oktoba 20,2020 dapụtachara. Odochabeghị anya etu Enadhuze si nwụọ. Akụkọ ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ mgbọ ojii tụrụ ya oge a na-egbochi ndị na-eme ngagharịiwe. Mana otu onye aha ya bụ Modorima Shintaro na Twitter, onye sị na ya bụ nwanne Oke, kọrọ etu o si nwụ, ma kwuo na ọ bụ mgbe ndị na-agboro wakporo ha n'ụlọ ha ka ha ji mma sụgbuo ya. BBC ka na-enyocha ihe niile a iji chọpụta nke bụ eziokwu kpọmkwem. Mana lee ihe ndị ọzọ anyị chọpụtara maka nwa amadị a Oke Obi Enadhuze bụ onye nhazi teknụzụ na-eme ka ibi ndụ dịrị ụmụ ụwa mfe nke a na-akpọ App designer n'asụsụ bekee. Enadhuze gụrụ compụta sayensi na mahadum Federal University of Abeokuta. Ọ na-arụ n'ụlọ ọrụ akpọrọ 'Life bank Nigeria'. Onyeisi Oke n'ọrụ bụ Ayo olufemi Michael kwuru na Oke arụọrụla ha teknụzụ ha mabeghị ma o nwere onye ga-arụ na nso nso a. O kwuru na ha hụbeghị udiri ọnatarachị Oke nwere ma bịa n'ihe gbasara teknụzụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ Oke Obi-Enadhuze na sọshal midia Derinmama bụ ọyị nwaanyị Oke pụtara jiri akara twitter ya depụta obi mgbawa ya maka etu e si sugbuo ọdịnobi ya. O depụtekwara na ihe Daniel Oke Enadhuze kọrọ n'akara twitter ya maka etu Oke Obi-Enadhuze si nwụọ bụ eziokwu. Mana ọtụtụ mmadụ na-ekwu na soshal midia na ọnya dị n'ahụ Oke tupu ọ nwụọ dị ka ọnya mgbọ egbe tụrụ ya. Temie Giwa-Tubosun bụ onye ụlọ ọrụ nwa amadi kwuru na Enadhuze haziri teknụzụ na-enye aka ndi nwee ike ịtụkọta ọbara ha iji nyere ndị ọbara ha gbaturu aka. O kwukwara na o ji naanị abalị anọ hazie ya. Seiyefatj kwuru na ọnwụ Enadhuze na-ewute ya nke ukwu Nubiudodo kwuru ka chukwu gbadata nyere Naịjirịa aka" 42884030,https://www.bbc.com/igbo/42884030,Mwakpo ndị Boko Haram n'ọnụ ọgụgụ,Onyeisiala Nịajirịa bụ Mohammadu Buhari ekwuola oge niile na emerịela ndị otu Boko Haram mana nyocha BBC mere n'egosi ihe dị iche,"Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda Nyocha ndị BBC Monitoring gosiri na otu ahụ egbuola ndị mmadụ karịrị narị itoolu n'afọ 2017 karịa ndị ha gburu n'afọ 2016. Ha mere nwakpo n'esepughi aka n'ime afọ nke megidere ihe Buhari kwuru na asụpụla ha. Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ ndịa n'ime mapụ nke na-egosi ụdị nwakpo Boko Haram na-eme, ebe ndị ha wakporo na ọnwa nke kachasị njọ Kedu ndị bụ Boko Haram? Boko Haram malitere ibuso Gọọmenti Naịjirịa agha n'afọ 2009 n'ebum n'obi ihiwe Islamic Caliphate na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịrịka. Olekwasịrị anya na mpaghara ọwụwaanynwụ-ugwu nke Naịjirịa ebe ọgbaghara a gburula mmadụ puku narị abụọ, chụpụkwa ndị ruru nde abụọ n'ụlọ ha Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda Boko Haram nke onyeisi ya bụ Abubakar Shekau kpọrọisi ala nye otu Islamic State (IS) na Maachị 2015 Boko Haram kewara n'ime otu dị icheiche n'ọgọsụtụ 2016 mgbe IS kwuru na ewepụla Shekau dịka onyeisi Otu ejiri gbakọọ ọnụọgụgụ Onye ntaakụkọ lekwasịrị anya na Naịjirịa bụ Andrew Walker gwara ndị BBC Monitoring na ọdịghị mfe ịgbakọ wakpo niile ha nwere maka ụdị ntaakụkọ ọdịnaala nke Naịjirịa Ọnụọgụgụnwakpo na-arị elu n'ọtu ebe Akụkọ kwuru na Boko Haram mere nwakpo dị otu narị na iri ise n'afọ 2017, nke karịrị ndị ha meburu n'afọ ndị gara-aga dị otu narị na iri abụọ na asaa Ebe ha mere nwakpo karịsịa n'ọnwa Jenụwarị, nke megidere ihe onyeisiala Buhari kwuru na ha nwụọla Mapụ Nwakpo Ndị otu a na-awakpo otu ebe kamgbe afọ abụọ gara-aga. Naịjirịa bụ ebe akacha wakpo n'afọ 2016 na 2017 dịka Borno Steeti bụ ebe nwakpo a bidoro. Mba Nijee nwetara nwakpo kachasị obere Ha wakporo mba ndị ọzọ dịka kameruun, Chadị na Nijee n'afọ 2017 Mapụ Nwakpo Mapụ nwakpo Usoro nwakpo Akụkọ kwuru na Boko Haram jịrị ngwaagha mee nwakpo iri itoolu, ebe ha jịrị ogbunigwe mgbagbuonwe wakpo ugboro iri ise na itoolu n'afọ 2017 Ebe nwakpo ha na mpaghara Kameruun na Chadị karịrị na ndị ha jiri nwaagha mee n'afọ 2016. Mapụ nwakpo Mapụ nwakpo N'ime ozi a, Naịjirịa nwetara nwakpo ejiri ogbunigwe mee dị iri na itoolu n'afọ 2016 na nke dị iri atọ na asatọ n'afọ 2017, ebe Kameruun nwetara ihe yiwere ya n'ọnụ ọgụgụ ogbunigwe mbagbu onwe karịrị na mpaghara Maiduguri nke Naịjirịa. Ọnụ ọgụgụ ndị egburu na-arị elu Ndị Boko Haram gburu ihe karịrị mmadụ narị itoolu na iri isii na asaa n'afọ 2017, nke karịrị mmadụ narị itoolu na iri n'afọ 2016. Ebe akacha gbue ndị mmadụ na Maiduguri n'afọ 2017 dịka ndị mmadụ agbala ọsọ ndụ Ebe ndị ọzọ egburu ndị mmadụ bụ n'ime obodo Magumeri, Konduga, Damaturu na Mubi Ọtụtụ ndị mmadụ Boko Haram gburu n'afọ 2016 na 2017 bụ ndị bi n'ime obodo n'akwa ndị agha Ndị Boko Haram na-aga n'ịhụ n'ịwakpo ụlọ ndị alakụba n'akwa ndị gbara ọsọ ihe ize ndụ (IDPs) Mapụ nwakpo Ihe jịkọtara Boko Haram na IS A matabeghị ihe jịkọtara Boko Haram na IS Nanị nwakpo iri na atọ n'ime nwakpo dị otu narị iri ise na otu bụ ihe ndị IS kwetara n'ọbụ ha mere Nke a nwere ike ị bụ maka agha ndị agha Sirịa na Ịraakị busoro ndị IS nke mere ha jiri gbafuo n'ebe ha kpọrọ ụlọ ha n'afọ 2017. Dịka otu ndị Boko Haram siri akpa agwa mere na IS enweghị ike ịkọrọ n'ọbụ mere ụfọdị nwakpo ha na-eme. Gịnị mere Boko Haram jiri esionwu? N'ime afọ anọ, ndị mmadụ akatọọla ndị isiagha naịjirịa maka akwadoghi ndị agha nkeoma ibuso ndị Boko Haram agha Nke a nwere ike igbanwe n'afọ 2018 dịka ndị mba Amerịka ekwetala iresi ndị Naịjirịa Ngwaagha Tupu oge ahụ eruo, otu a ka na-akpa ike na-iyi ndụ egwu dịka Tomi Oladipo onye ntaakụkọ BBC Afịrịka kwuru. Ndị agha Naịjirịa na-ahụsi anya n'ibuso ndị Boko Haram agha ""Agbanyeghị okwu ndị Gọọmenti Naịjirịa n'ekwu na ha emeriela Boko Haram, ndị otu a ka na-awakpo na eyi ndụ ndị Naịjirịa bi na mpaghara ọwụwanynwụ ugwu n'akwa mpaghara Chadị"" dịka o kwuru Oladipo kwuru na Boko Haram na-ezoezo nke mere o jiri dị ike n'ibu agha rute ugbua ""N'ime ọtụtụ afọ ike ndịa nwere ịbata n'ime obodo soro ndị mmadụ biri n'akwa izo onwe ha n'ime obodo bụ ihe nyere ha aka n'ịkpa ike dị egwu"" Oladipo kwuru." afirika-50114921,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114921,Nnamdi Kanu: O bola ọnwụ nne ya n'isi ndịagha Naịjirịa,Nne onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob)' bụ Ugoeze Sally Nmeme Kanu anwụọla.,"Nwa ya nwoke bụ Nnamdi Kanu kwuru na nne ya nwụrụ kemgbe ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Ọgọstụ mana o bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba ka o kwuputara ya. N'ime onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia, o toro nne ya maka etu o si kwado mbọ Ipob na-agba ịnweta Biafra mgbe ọ dị ndụ. Content is not available End of Facebook post, 1 Kanu kwuru na ọ bụ ihe mgbu na obi mgbawa si n'egwu eke ndị Naịjirịa mere n'afọ 2017 na be ha n'Afaraukwu dị n'Ụmụahia, Abia steeti, gburu nne ya. Ihe ndị Ipob kwuru maka ọnwụ nne Kanu Ụkọchukwu Chukwudi Peace gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe ọbụla sọrọ Kanu ka ọ ga-eji ekwupute ọnwụ nne ya makana onweghị onye ọ gbasara. O kwuru na ọ bụghị ihe ọhụrụ na Kanu ji ugbua ekwupute maka ọnwụ nne ya mere n'Ọgọstụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ nne Nnamdi Kanu Mberede okporoụzọ ejidela otu onye n'Ọnịcha Akụkọ si Ọnịcha eru anyị ntị na-akọwa na ụgbọala pịara otu nwaanyị gwogwo n'okporoụzọ e si abanye Ọmọba (bụ ebe ọkụ tanka gbara ụgbọala 22), na mgbede ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba. Nwaanyị ahụ nke a na-amabgehi ma ọ nwụọla pịị tọgbọrọ n'okporoụzọ, mana ndị mmadụ gbara ya gburugburu na-ekwu na ọ nwụọla. Ndị mmadụ hụrụ ka ihe mberede a mere, kwuru na onye na-akwọ ụgbọala kụrụ nwaanyị a ka ọ na-achọ ịgbafe n'ụzọ, ma hapụ ya gbalaga ka ọ hụrụ ihe o mere. N'ihe nkiri si n'ọgbọ ahụ pụta, onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka ndị ọrụ ha bụ ichekwa ụzọ nke a na-akpọ Federal Road Safety Corps (FRSC), gara ka ha mara ihe a ga-eme. Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD Ị na-eji MTN gị ekesa ego nke Bekee na-akpọ Bank Transfer? Ụjọ atụla gị makana ha agaghị ana gị ego USSD. Nke a bụ makana minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Isa Ali Pantami, enyela iwu ka ha gbaa brake ruo mgbe ọ tulechara ya, makana ọ sị na ọ maghị maka ya, nke o ji edo ya anya. Gụọ ya n'uju ebe a: Ụjọ atụla gị MTN agaghị ana gị ego USSD Ngagharịiwe ndị Hong Kong Ndị na-eme ngagharịiwe tụrụ mgbọ mmanụ agbịdị n'ụlọọrụ ndị uweojii N'ofesi, ndị mba Họng Kọng egosila na ha bụ isi ekwe ọnwụ dịka ha jụrụ ịkwụsị ngagharị iwe ha malitere kemgbe izu iri abụọ gara aga. Ọ bụ otu iwu ọhụrụ e wepụtara nke ga-eme ka e nwee ike ịkpọpụta ndị a na-enyo maka mpụ n'ike ma kpọba ha Chaịna, kpalitere ngagharịiwe a. Lee ndị meriri na Headies 2019 Ọ bụ Nancy Isime na oti egwu bụ Reminisce haziri emume Headies nke afọ a. Lee ụfọdụ ndị meriri nke afọ a. Ogụegwu nke afọ 2019. 'Burna Boy' Egwu kacha n'afọ 2019 'Burna Boy' Onye a na-atụanya ịkpa ike n'ọdịniihu 'Rema' Onye kacha emepụta egwu nke afọ 2019 'Killer Tunes' Ọgụegwu olu ya kacha mma 'Teni' Nchịkọta egwu n'afọ 2019 'Falz' Ihe onyonyo egwu kachasị 'Clarence Peters' Onye meriri 'Best Performer' Yemi Alade Ụlọ mkpagbu ọzọ ji mmadụ 147 na Kaduna Ufọdụ ndị azọpụtara bụ ụmụnwoke kwuru na awakporo ha Achọpụtala ụlọ mkpagbụ ọzọ ji ndị mmadụ otu narị iri anọ na asaa na Rigasa,nke dị na opkuru ọchịchị Igabi, Kaduna steeti. Ha dị ụmụnwoke otu nari iri anọ na asaa, ụmúnaanyị iri abụọ na abụọ ebe ọtụtụ ha bu ịga ma ụfodụ kwukwara na a na-awakpo ha n'ike. Ọ bụ Gọvanọ Kaduna steetị bụ Nasir El-Rufai na ndị uweojii soro zọpụta ndị a. Onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari katọrọ mkpagbụ ndị a ma nye ndị nchekwa ikike ichopụta ndị ọzọ ebe ọbụla ha di. Enwetela Ọdụm gbapụrụ n'ogige a na-edewe anụmanụ na Kano Ọdụm bi n'ogige a na-edewe ụmụ anụmanụ dị na Kano agbapụla na-ebe edewere ya. Ndị na-elekọta ya sị na ọ bara ebe ewu nọ were nyere onwe ya aka ma rijuo afọ. Ha sị ka ndị mmadụ hara itu egwu n'ihi na ha anwụchiela ya bụ Ọdụm. Atọrọla otu onyeisi ndị uweojii Ndị ntọ ekwuola na ha chọrọ nde Naira iri ise tupu ha ahapụ onye uweojii na-achịkọta ndịuweoji na Suleja aha ya bụ Isa Rambo ha tọrọ. A tọrọ Rambo bụ onye eneyemaka Kọmishọna mgbe o si Kaduna a ga Jos na ụtụtụ Saturday. Ọnya Boko Haram amaala Boko Haram Ogbunigwe a na-eli n'ala Ọnya Ogbunigwe ndị Boko Haram liri n'ala egbuola ndị otu ha asaa ma mee ka asatrọ n'ime bụ daa ngwụrụ. Ọ bụ ebe ha na agba ọsọ dịka ndịgha Naịjiria na akwa ka mgbọ ka ụbgọala ha riri ya bụ ọgbunigwe elu. Nke a mere na ime ọhịa Lamb'a. Ka ọ dị ụgbụa, ndịagha NAijirịa na echekwa mpaghara a. N'Ofesi Brexit Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson edegerala ndị EU akwụkwọ ka enye ha oge karịa ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Oktober maka Brexit. Nkea bụ maka iwu ndị omeiwu nyere ya, kama Boris Johnson degekwara ndị EU akwụkwo ọzọ were sị ha na Brexit igafe ụbọchi amara ọkwa ya dị njọ. N'Egwuregwu Asọmpi CHAN agbanagharịla ha Ndị otu sụper Eagles agaghi eso zọọ ikọ asọmpi 'African Nations Championship'nke afọ 2020 dịka ndị Togo ji ọkpụ goolu anọ ha satara atọ were gbapụ ha. Togo ji goolu anọ ha satara otu were merie ndị Super Eagles na agba nke mbụ maka ntozu asọmpị CHAN. Ndị Super Eagles na-atụanya na ha ga abụkwara ma nye goolu karịrị abụọ mgbe ha ga-ezute na Legos. Kama nke a bụ akụko ifo dịka ndị Akụko Ga-Amasị Gị Nkeji Akụkọ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" egwuregwu-44363632,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44363632,Iko mba ụwa 2018 fọrọ abalị asaa: Họrọ ndị ọgba bọọlụ Afrịka kacha masị gị,Mba Afịrịka ise na-agba n'asọmpị iko mba ụwa 2018 na Rọshịa.,"N'afọ ndị gara aga, e nwela ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Afịrịka pụrụiche gbara n'ọgbọ ụwa niile. Jiri atụmatụ anyị họpụta otu ndị ọgba bọọlụ Afịrịka kacha masị gị site n'aha ndị ọkachamara n'ihe gbasara bọọlụ nke BBC wepụtara. Kekọrịta otu gi n'ime ndị enyi gi ma nweta kwa ozi gbasara akụkọ iko mba ụwa nke ndị ọgba bọọlụ gị. Kesaa otu gị Kesaa otu gị Onye mere ihe a Etu eji mere ihe a" afirika-50774247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50774247,Duncan Mighty: Ndị Uweojii atọhapụla oti egwu a,Oti egwu a ma ama bụ Duncan Mighty enwerela onwe ya n'aka ndị uweojii Imo Steeti.,"Duncan Mighty Nke a bụ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Orlando Ikeokwu. Ikeokwu kwuru na otu onye ọnụ na-eru n'okwu bịara gbaara Duncan Mighty akaebe nke mere e ji tọhapụ ya. Mana ọ ga-abịaghachi n'ụlọọrụ ndị uweojii n'izuuka na-abịa abịa. N'ehihie Satọdee ka akụkọ malitere rịwa ibe ya elu etu ụmụ dimkpa bucha egbe si nwụchie Duncan Mighty n'Owere. Ọtụtụ ndị mmadụ che na ọbụ ndị ntọrị tọọrọ ya. Mana ndi uweojii kọwara na ọbụ ha nwụchiri ya. Orlando Ikeokwu kwuru na ha nwụchiri nwa amadị a maka nrụrụaka dịka ulọikpe nyere iwu ka ejide ya. Maazi Ikeokwu sị na ọ bụ maka ego aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha nyere oti egwu a ka ya na onye egwu ọzọ aha ya bụ M2 jiri kụọ egwu. Dịka Ikeokwu siri kọwa, ha nwụchiburu Duncan Mighty dịka M2 wetere ha mkpesa, o wee kwee nkwa na ya ga-emezu nkwekọrịta ha. Ego na-ese okwu bụ nde naịra iri na otu (N11 million) bụ nke Gọvanọ Okorocha nyere Duncan Mighty. Ikeokwu sị na ha hapụru oti egwu mgbe ahụ, mana o meghị ihe ọ sị na o ga-eme. Onweburu oge Duncan Mighty tiri mkpu maka ihe ọ sị na ya na-agabịga maka okwu a. M2, onye ezigbo aha ya bụ Amaechi Perfect Gideon, bụ onye mbem a ma ama na steeti Imo nke mere gọọmentị steetị ahụ jiri chọọ inyere ya aka. Ndị uweojii sị na ọ bụ ụlọikpe nyere ha ikike ha ji nwụchie Duncan Mighty bu onye ha sị nọ n'ogige ha n'Owere ugbua. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ikuru ịgwamang Legọs: 'onye ntorobịa na-emeghị emume a etozubeghị' - Ndị Abiriba" afirika-46190831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46190831,Ihe ise ị maghị maka 'Spiderman',Ọ na amasị gị ikiri ihe onyonyo eserese 'Spiderman' mana ị maghị ka akụkọ ya bụ agwa siri bido?,"Stan Lee bụ odee ihe eserese wepụtara agwa Spiderman, Incredible Hulk na agwa ndị ike ndị ọzọ a mara amara Ụwa niile nọ n'iru ụjụ maka ọnwụ Stan Lee bụ One midoro agwa 'Spiderman.' Lee so n'otu n'ime ndị bidoro 'Marvel Comics' bụ ụlọrụ na-eme ihe onyonyo nakwa akwụkwọ egwuregwu ụmụaka nke a kpọrọ comic books na bekee. Ọrụ ndị ọzọ e ji mara Stan Lee gụnyere ihe nkiri eserese a kpọrọ Spiderman. Dịka ụwa niile na-ebe anya mmmiri maka ode ihe ọchị a, lee ihe ndị i kwesiri ị ma maka nwoke a: 1. Ezigbo aha ya bụ Stanley Lieberman Mana ọtụtụ mara ya dịka Stan Lee bụ aha ọ zawara n'ihi ihere ọ na-eme na-eme ya. Ọ chọghị ka a mara na ya na-ede akụkọ ịkpa ọchị na 'Marvel Comics' ebe ibe ya na-aga ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dịbịa bekee maọbụ ọkaiwu. 2. Ihe e jiri mara Lee A mara Stan Lee maka ihe nkiri a ma ama dịka 'Spiderman', Iron Man, 'Avengers', Black Panther,'Captain America' ọkachasị ime agwa dịka 'Hulk', 'Spiderman' nakwa X-Men. 3. O bidoro n'ụtụtụ soro ebunuche ya n'iso akara aka ya O bidoro ọrụ ide akụkọ eserese ụmụaka n'ụlọọrụ na nwata. Ka o siri agba mbọ na ya mere ka e me ya onyeisi ndepụta akụkọ(Editor ) ihe eserese nke a kpọrọ 'cartoon'na bekee ka ọ gbara afọ 18. 4. Nwunye ya bụ Joan Lee nwụrụ n'afọ 2017 Nwunye Lee bụ Joan nwuru n'afọ 2017. Ihe e ji echeta Joan bụ nwafọ Briten bụ na ọ bụ alo ya tụnyere bunyere Stan Lee uche ị gaghachi n'ide akụkọ ọchị a kpọrọ 'Fantastic Four' nke wuru ewu n'afọ 1961. 5. Ọ bụ na okenye ya ka kpakpando Stan Lee chawara Ọtụtụ amaghị na Stan Lee bụ nwa amụghị n'ime ego. A mara Stan Lee maa ihe nkiri ọ sonyere na ya nke gụnyere Spiderman, Avengers na ndị ọzọ Ọ bụ ka ọ lachara ezumike nka ka o nwere aka nchawa mere ya oke mmadụ site na ide agwa mechara dọta nde kwuru nde dọla dịka ihe nkiri. Iji maa atụ ihe nkiri 'Spiderman' nke pụtara n'afọ 2002 na nke so ya na 2004 nwetara ihe karịrị otu ijeri dọla( $1.6bn) Ihe ụmụ ụwa na-ekwe maka Stan Lee na soshal midia Stan Lee na-ewu na soshal midia kemgbe ọ nwụrụ. Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Emma Dilli kwuru na aga e ji ọrụ Lee echeta ya. @Blacktigerking678 kwuru na nagbanyeghị na ya ejighị anya ya hụ Stan Lee oge ọ dị ndụ, na ọrụ ya metutara ya n'obi. Rahma Sadau kwuru na a gaghị echefu Stan Lee ụwatụụwa. Tunde Agboola kwuru na obi dị ya njọ maka ọnwụ Lee." afirika-51938749,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51938749,Obiano's six years in office: Nke ọma na nke ọjọo Obianọ n'afo isii ọ chịri Anambra steeti,Ndị Anambara tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọchịchị Gọvanọ Willie Obiano dịka ọ chialaraafọ isii na steeti ahụ.,"Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Ụfọdụ kwuru na ọ gbara mbọ ma rụpụta ihe a hụrụ anya dịka n'ọrụ nchekwa obodo, ịkwụ ụgwọọnwa, iwulite okporoụzọ, itinye ọkụ n'ọkporoụzọ na ihe ọwụwụ ndị ọzọ. Mana ụfọdụ na-atụ aka ebe ndị ọ gbara ọnyụpa ọkachasị na iwulite ndị mmadụ nke Bekee kpọrọ human capịtal development' . Damian Okeke-Ogene bụ onyeisioche Ohaneze ndị Igbo nke Anambra kwuru na Obiano gbalịrị. O kwuru na ""Obiano ji azịza zaa Upper Iweka dị n'Onicha, ma mee ka ndị ekperima niile nọ ebe ahụ gbafuchaa."" Ọ gakwara n'ihu kwuo sị ""na Obiano na-agbalị n'ihu na udo chiri n'Anambra steeti"", na-agbanyeghị na ọnọdụ nchekwa jọrọ njọ na Naịjirịa niile. Damian Okeke Ogene bụ onyeisi Ohaneze ndị Igbo n'Anambra steeti Onye ọzọkwa kwuru okwu bụ Don Onyenji, onye ọrụ mgbasa ozi. Onyenji jakwara Obianọ ike ma kwuo na ọ rụrụ ọrụ ka dimkpa. Ma Onyenji ma Okeke-Ogene nkwado Obiano nyere Coscharis wee maa atụ. Coscharis rụrụ ụlọọrụ na-emepụta osikapa n'Anambra steeti nke bụ ọkaibe na Naịjirịa niile Onyenji nyere Obiano pasent asatọ n'ime iri maka ịrụsị ọrụ ike. O kwuru na Obiano tinyechara ọkụ n'okoroụzọ niile nke mere na egwu adịghịzị maka ịgagharị n'abalị. Banyere ajọ ụzọ dị n'Ọgbarụ, Onyenji sị na gọọmenti etinyebeghị aka n'ebe ahụ maka oke ego ya bụ ụzọ ga-eri. Don Onyenji bụ ọkachamara na ọrụ mgbasa ozi Ọ sịkwa na ọ bụghị naanị ya, na ihe mbuze na-eme n'Anambra steeti ka nkụ nke bụ na gọomenti steeti ahụ agaghị emenwu ihe dị na ya. Onyenji kọwara na gọọmenti Anambara ahụ akwụnyela ụgwọ nke ha maka ikpochi mbuze ndị ahụ, ma na-echezị ka 'World Bank' mezuo ya. Ndị ọrụ oyibo na ndị nkuzi na-enwe obi ụtọ maka ọchịchị Obiano n'ihi na anaghị ejizi ha ụgwọ ọnwa, dịka Onyenji si kwuo. Onicha bụ isiobodo azụmahị n'Anambra steeti Mana onye pati APC bụ Emeka Ibe sị na afọ isii Obianọ bụ afọ lara ndị Anambra n'iyi. Emeka sị na ""ọnweghị otu ihe ejidere aka Obiano rụpụtara n'Anambra steeti na-agbanyeghị ego niile gọọmenti etiti ma nke Peter Obi hapụụrụ ya"". O kwuru na ""a sị na ọ bụ naanị ụzọ Aguleri ka ọ na-arụ, mana gọọmentị bụ nke ndị Anambra, ọbụghị nke ndị Aguleri"". Emeka kwere nkwa na ya ga-ezitere anyị ọmụmaatụ ego ọ sị na a hapụụrụ Obiano nke o jighi rụ ọrụ. Onye ọzo anyị gbara ajụjụ ọnụ na-achọghị ịkpọ ha ya kwukwara na n'ezie na Gọvanọ Obianọ rụkwara ọrụ karịa ibe ya mana ụtụisi a na-ana ndị mmadụ ugbua karịri akarị. Ọ sị na ha na-anacha ndị ahịa mkpọsa ihe ruru narị naịra asatọ n'ụbọchị. O kwuru na-agwa ndị na-anata ya bụ ụtụisi na-akpasa ndị ahịa bụ nke ka njọ. Lee ihe ndị ọzọ adịghị atọ ndị Anambara ọchị n'ọchịchị Obiano: Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Obiano malitere ọchịchị oge Peter Obi rituru n'ọkwa dịka gọvanọ. Tupu oge ahụ, ọ bụ onye ọrụ ụlọakụ welitere isi. Ọ rụkwara ọrụ n'ụlọọrụ mmanụ agbidi dị icheiche dịka Chevron. N'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ 2014 ka e duru Obiano n'iyi ọrụ dịka gọvanọ Anambra. Akụkọ ga-amasị gị Explosion in Lagos: Anụtụbeghi m ụdịrị ụda ahụ mbụ" afirika-45430735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45430735,APC Imo chọrọ ntuliaka imeụlọ mmadụ ga-anọchite ibe ya,"Otu APC n'Imo steeti kwuru n'ụbọchị Toozde na ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ọchịchị niile maka afọ 2019 abụghị ndị niile a họpụtara ga-eso eme ya, kama ọ bụ ụfọdụ ga-anọchị anya ndị ọzọ.","ọgbaghara dị n'ime APC Imo steeti kemgbe ha mere ntuliaka imeụlọ ọnwa ole na ole gara aga Nke a bụ atụmatụ a na-akpọ 'indirect primaries' na Bekee ebe a ga-ahọrọ n'ime ndị nnochiteanya (delegates) ndị ga-eso mee ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ọchịchị niile. Otu kewapụtara na pati ahụ fọrọ ntutut taa na ha agaghị ekwe na ya bụ atụmatụ ma ncha. Ha kwuru nke a oge ha mechara nzukọ mberede nke imeobi steeti ahụ nke onyeisioche APC na steeti ahụ bụ Dan ọkafọr nọ n'isi ya. Ndị ọzọ nọ na nzukọ ahụ bụ Uche Nwosu bụ onye chọrọ ọkwa gọvanọ nakwa onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Achọ Ihim Na mkparịtaụka BBC na otu onye nwere agba na APC Imo steeti bụ Ogueri Isiguzo nwere n'ekwenti, o kwuru na ndị na-akpa nkata 'indirect primaries' a bụ ndị otu gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Rochas Okorocha, na ọ bụghị ebumnobi otu APC niile na steeti ahụ. Isiguzo gara n'ihu jụọ sị, ""Kedụ ka otu onye ga-esi wepụta ndị ga-azọ ọkwa na aha pati? Pati bụ okwu nkwekọrịta ndị nọ n'ime ya."" Ndị nọ na nkewapụta otu APC ndị akwadoghị nnọchite ibe na ntuliaka ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị n'aha pati APC gụnyere onye bụbụ osote gọvanọ bụ Eze Madumere, Emeka Nwajiụba, Sinetọ Ben Uwajumogu, Jasper Azuatalam na Osita Izunaso na ndị ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 50844515,https://www.bbc.com/igbo/50844515,Nigeria Inflation: Ọnụahịa ejirila pasenti abụọ ria elu kamgbe Ọktoba 2019 - NBS,Gọọmentị site n'aka ndị National Bureau of Statistics (NBS) kwetere n'ezie na ọnụahịa ji ihe dịka pasenti iri na otu na ụma (11.85%) rịa elu.,"Nke a pụtara na ọnụahịa ejirila ihe ruru pasenti 0.24 ria elu kamgbe ọnwa ọktoba afọ 2019. Ndị ọrụ a kwuru nke a n'akwụkwọ ha kpọrọ 'ITS Consumer Price Index (CPI) and Inflation' nke ha wepụtara n'ọnwa Nọvemba 2019. Dịka Ekeresimesi na-atụnye ụkwụ ihe oriri ụfọdụ arịala ọnụ ebe ụfọdụ dara ada. Ebe gọọmenti na ndị ọrụ ugbo na aṅụrị n'ọnụahịa osikapa rịrị ọnụ ugbua maka okeala Naịjirịa e mechiri, ndị na-azụ azụ na-eti mkpụ na ọnụahịa nrị dị oke ọnụ. Nke a mere BBC Igbo ji gbawa ndị mgbere osikapa ajụjụ ọnụ ịmata ka ihe siri kwuru n'ahịa osikapa, iji maa atụ. Toyin Lawal bụ onye na-ere ahịa nri n'Enugwu ji Igbo kọwa ihe ọ na-eri ha na-ere osikapa site kemgbe Jenuwarị. Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị? Toyin sị na Jenuwarị ruo na Maachị ha rere akpa osikapa puku naira iri (N10,000) nke gbara narịa iri ise n'otu iko. N'ọnwa Apreelu ruo Mee, ha rere otu akpa osikapa puku naịra iri na atọ ruo iri na anọ (N13,000 - N14,000) bụ nke gbara naịra iri isii maọbụ iri asaa n'otu iko. Ebe ahụ ka o si rigoo puku naịra iri na anọ na Seputemba. Mgbe ọnwa Nọvemba ruru, akpa osikapa ruru ọnụ puku naịra iri na isii. Ebe ahụ ka o si ruo ebe ọ nọ ugbua bụ puku naịra iri na asatọ kwa otu akpa. Nke a bụ ọnụahịa osikapa Naịjirịa, ebe nke ofesi nọ na puku naịra iri abụọ na anọ otu akpa (N24,000). Lee ihe nkiri a Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị? Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50313834,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50313834,Sanwo-Olu abụghị onye mbụ gbajọrọ ịza 'His Excellency','His Excellency' na 'Mr Governor' na-ewu ugbua na soshal midia n'ihi okwu Gọvanọ Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu kwuru.,"Sanwo - Olu kwuru na ọ ga na-aza ""Mr Governor"" kama ""His Excellency"" iji gosi obi umeala na ijere ndị Legos ozi dịka ọ kwesiri. O kọwara na ""His Excellency"" na-eme ka onye nọ n'ọchịchị na-ebuli onwe ya karịa ọkwa ya. End of Twitter post, 1 N'agbanyeghi ihe a o mere, ndị mmadụ si n'ụzọ di icheiche nabata ya. Etu ndị mmadụ si nabata mgbanwe aha a Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Cheta Nwanze kwuru ka Sanwo-Olu chee ihe chere ya n'ihu. ""Ihe Sanwo Olu mere bụ ihe Bekee kpọrọ ""soft sell"", ihe dị mkpa bụ ịrụ ọrụ, ọ bụghị aha"". Ndị ọzọ kwenyere n'ihe Cheta kwuru bụ Captain Obvious si ya tinye anya n'ọchịchị bụ ihe dị mkpa. N'aka nke ọzọ onye dịka Mazi Waltz na-ekwu ka gọvanọ steeti ndị ọzọ nyomie ya. Gọvanọ ndị ọzọ gbahapụrụ echichi ""Your Excellency"" - Aka chiburu Niger state n'afọ 2007 bụ Muazu Bbangida Aliyu kwuru ka a kpọọ ya ""The Chief Servant"" mgbe e duchara ya n'iyi ọrụ - N'afọ 2015, aka chiburu Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi kwuru ka akpọọ ya ""Abiola Ajimobi"" sọsọ. - Ebe ọgbọ ya bụ Rauf Aregbesola kwuru ka a kpọọ ndị Gọvanọ ""Mr Governor"" kama His Excellency." afirika-50670584,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50670584,Orji Uzor Kalu: 'Mkpọrọ afọ 12 a gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs,okaikpe Muhammed Idris maala Orji Uzor Kalu ikpe maka mpụ na nrụrụaka nke a malitere inyocha ya kemgbe afọ 2007 ọ chịchara dịka Gọvanọ.,"A mara Kalu Ikpe ibuba ego dị ijeri asaa, iri isii na ise (7.65bn) bụ nke ha na Udeh Udeogu bụbu onye okwu ego dị n'aka na n'ụlọomeiwu Abia steeti mgbe Orji Uzo nọ na ọchịchị bubara mgbe ọ na-achị Abia steeti. Content is not available End of Facebook post, 1 Nke a bụ afọ iri na abụọ e kpere ikpe a kwuru taa. Ụlọikpe ukwu dị na Legọs nyere iwu ka ọ rahụ n'ụlọmkpọrọ Kirikiri bido taa, ma kwuo na o nwereike ịnọgide ebe ahụ ruo afọ iri na abụọ. Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) boro Kalu, Ụlọọrụ ya bụ Slok Nigeria Ltd and Udeh Udeogu ebubo ịchịba ego ndị Abia steeti karịrị narị ijeri asaa. Ọkaiwu Rotimi Jacobs bụ ọkaiwu EFCC n'ikpe a sị na ha ga-ere ụlọọrụ ya bụ Slok Naịjirịa. Ọ sị; ""Ọ bụ kemgbe 2007 ka anyị malitere ikpe a, nke bụ na onye bụ Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa n'oge ahụ bụ Michael Aondoaka chọrọ imebi ya bụ ikpe site na-ịsi na agaghị agbanwu onye ka sị ọchịchi rituo ikpe."" ""Anyị lụrụ ọgụ ikpe a ruo afọ iri asatọ ma ruo Ụlọ Ikpe Ukwu. Ọkaiwu EFCC n'ikpe Ọrji Uzor Kalu bụ Ọkaiwu Rotimi Jacobs ""Ikpe gosiri na mmadu ekwsighi ịda mba n'ịchu eziokwu ma gosikwa na ọ ka nwere ndị ọkaikpe aka ha dị ọcha."" Ihe chere Maazị Kalu ugbua bụ mkpọrọ ihe ruru afọ atọ maọbụ afọ iri na abụọ maka otu ebubo n'ime ebubo iri atọ n'itoolu."" Ọkaiwu Kalu ekweghị ekwu okwu ka amara ya ikpe a. Ọkaiwu Jacobs si na ihe a gosiri na mmadu banyere otu patị na-achị bụ All Progressives Congress (APC) ọ gbanarị ikpe. Ọ sị; ""Ihe a bụ gọvanọ anọ m so kpee ikpe ya."" N'ọnwa Epurel ka Ụlọ Ikpe Mkpesa dị na Legọs gbajọrọ arịrịọ Orji Uzor Kalu ka ọ sị na onweghi azịza maka ebubo na oriri ego Abia steeti mgbe o bu gọvanọ. Ihe Kalu gwara kwuru ka o na-aga mkpọrọ bụ ""2023 lekwa ka anyị na'abịa!"" Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ebe a na-akpọba ya na mpaghara mkpọrọ dị n'ụlọikpe ukwu n'Ikoyi." afirika-44505420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44505420,Ọgụ anyị na ndịagha n'aba bụ 'obele nsogbu' anyị na-ahazi - onyeisi uweojii Imo,Onyeisis ndị uweojii n'Abia steeti bụ Mike Anthony gwara BBC Igbo n'ọgbaghara daara n'etiti ndị ọlu ya na ụfọdụ ndịagha Naịjirịa na steeti ahụ ụnyaahụ bụ 'obele esemoku'.,"Oteela ndị uweojii na ndị agha na-enwe mkpakpa di icheiche na Naịjirịa Cheta an ọgbaghara banyere Osisiọma nke dị n'Aba n'Abia steeti ụnyaahụ mgbe ndịagha Naịjirịa na ndị ọgbọ ha bụ ndị uweojii kwara mgbọ. Anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na nsogbu bidoro mgbe ndị agha kparala onye uweojii aka ma chọ ịkpụba ya n'ụlọọrụ ha. Ndị ntaakụkọ na-ekwu na mgbọ egbe gbụrụ mmadụ atọ n'ọgbaghara a ka ndị ọzọ ekwughị ole ha dị merụrụ ahụ. Dapchi: Ndị agha na ndị uweojii enwela nghọtaghi Ndịagha so n'ihe mere bụ ndị a na-eche na ha si ụlọakwụkwọ Ngwa High bụ ebe ha nwere ọgbọ akpọrọ ""Forward Operation Base"" ebe ndị uweojii aka ha dị na ya si ""Mobile Police Force (pmf 55) Unit"" nke dị n'Osisioma. Ọbụghị mbụ ndịagha na ndi uweojii na-akwata ya. Cheta n'ọnwa gara aga, ndị uweojii na ndịagha lụru ọgụ na Pọtacụt. Maazi Anthony etinyeghi ọnụ ajụjụ BBC Igbo jụrụ ya banyere ọnwụ na mmerụ ahụ mana okwuru na ndị isi na ngalaba nchekwa ahu na-entinye ọnụ na ya bu oku. BBC Igbo gbara mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Texas Chukwu mana ọ zaghị ekwentị ya maọbụ saa ozi anyị degara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43647420,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43647420,Buhari maputara otu ijeri dọla maka izụ ngwaagha,Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na Onyeisiala Mohammadu Buhari amapụtala ego dị otu ijeri dọla maka iji zụọ ngwaagha eji ebuso ndị na-eyi ndụ egwu agha.,"Ndọrọndọrọ banyere otu ijeri dolla a eji a zuta ya bụ ngwaaagha bidoro n'ọnwa 2017 Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali kwuputara nke a na-ngwụcha nzụkọ ha na Buhari nwere ụnyaahụ. Mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'ọkwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola uche ha gbasara ya bụ mkpebi. Akụkọ na-ekwu na Buharị maputara ego a n'azụ ndị Sineti. Otu onye n'ime ha bụ Ike Abonyi ,onye otu patị akpọrọ PDP si na o kwetere na-ekwesiri ị gbochị ndị oyi egwu mana, ndị nọ na ọchịchị ụgbua anaghị ekwu eziokwu. O kwukwara na ọchịchị Buhari agaghị eji ego a wee zụta ngwaagha maka ibuso Boko Haram agha. Gere ihe okwuru ebe a n'uju: 'Ndị ọchịchị Buharị anaghị ekwu eziokwu' O teela ndị Boko Haram jị eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Ugwu Naijiria. Mana onye odee akwụkwọ partị nọ n'ọchịchị bụ APC nke mpaghara Lagos steeti aha ya bụ Joe Igbokwe kwuru na Buhari ga-eji ego ahụ wee meekpa ndị oyi ndụ egwu ahụ. O gwara ndị mmadụ na ha atụla ụjọ makana onyeisiala agaghị emefusị ego a n'ihi na ọ bụghị onye ego na-atụ n'anya . O kwuru na APC adịghị ka PDP mefusiri ego Naịjirịa mgbe ha nọ n'ọchịchị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 43006616,https://www.bbc.com/igbo/43006616,Arsenal na Tottenham: Asọmpị nke ndi dike,Arsenal na Tottenham ga-asọmpi echi n'ọgba egwuregwu nke Webley.,"Lucas Moura bụ onye ọhụrụ otu Tottenham nwere ike ị so na asọmpi nke a Ugbu a Arsenal na-akwado ị ga Wembley maka asọmpị iko Premier League. N'okpokoro na-egosi pointi, Arsenal ji pointi anọ nwe karị Tottenham. Arsenal nọkwa na ọnọdụ nke isi. Ndị hụrụ Arsenal n'anya, na-atu egwu maka onye nche bọọlụ bụ Petr Cech nwere ike anaghị eso na asọmpi nke a maka o merụ arụ ụkwụ. Onye nkwụzị ndị Tottenham bụ Mauricio Pochettino ekwuola ""A bụ m onye na-ekweta na ihe di mma ga-eme. Asọmpi nke a ga esị ike"" Arsene Wenger bụ onye nkwuzi otu Arsenal kwuru na ""Ị le anya n'okpokoro, ị ga-ahụ na asọmpi nke a di ezigbo mkpa ị nwe mmeri"" Asọmpi nke a ga-eme na elekere abụọ na ọkara n'ehihe nke echi na oge anyi na Naijiria." media-47457256,https://www.bbc.com/igbo/media-47457256,Election 2019: Ka Inec n'ọwụwa-Anyanwụ si eke nkwụcha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ,Ka Inec si akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ. N'Anambara steeti,"Ndị ọrụ ngo Inec n'Anambara steeti, na-achọ aha ha Ụlọọrụ Inec dị n'Ọka, isiobodo Anambara Steeti, amalitela ikesa ngwaọrụ ndị kacha dị mkpa nakwa ndị ọzọ a ga-eji mee ntuliaka nke ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nke steeti n'ụbọchị Satọde. Inec ji ụgbọala ndị FRSC were na-ekesa ngwaọrụ ha ga-eji eme ntuliaka na mpaghara dị iche iche n'Anambara. A ga-echeta na Anambara Steeti agaghị esonye na ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ nke afọ a bụ 2019. Makana ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ n'Anambara Steeti, e ji họpụta Willie Obiano, bụ nke e mere n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba, 2017. N'Abịa steeti, Ka onye ntaakụkọ BBC bịara n'ụlọọrụ CBN bụ ebe a na-ekesa ngwaọrụ ndị Inec ga-eji mee ntuliaka, ndị uweojii gbara ebe ahụ gburu gburu. Mana dịka onye ntaakụkọ anyị ahụ kwuru, e kweghị ndị ntaakụkọ bata n'ime ebe a nọ eke ya. N'Imo steeti Ụlọọrụ Inec dị n'Imo steeti amalitela ikesa ngwaọrụ a ga-eji mee ntụliaka na steeti ahụ. Na mgbede ụbọchị isii n'ime ọnwa Maachị ka ha bidoro na-ahazi ya bụ ngwaọrụ n'usoro okpuruọchịchị dị iche iche tupu ebugawa ya ebe ahụ. Nke a na-eme n'ụlọọrụ ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN dị n'Imo steeti. Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Imo steeti bụ ọkammụta Chukwuemeka Ezeonu, kwuru na ha ahụla na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-ata ezigbo akpụ, ya mere ha ji akwado n'oge ka ihe gaa nkeọma ụbọchị ahụ. Ọ gara n'ihu nyocha ngwaọrụ ndị ahụ mara ma ha ezukwara ezu. N'Ebọnyị, Inec Ebọnyị steeti na ndị ọrụ ngo a kpọrọ ""Ad hoc staff"" na Bekee, na-enwe mkparịtaụka maka nkwado ntuliaka nke gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti, ịkọwara ha ọrụ ha ga-arụ, na ebe e zipuru ha maka ya bụ ọrụ. Ọkammụta Godswill Obioma bụ onye nọ n'isi mkparitauka a, sị na ọrụ ha dị ụzọ atọ; Wọọdụ, okpuruọchịchị na steeti. Ndị ọrụ ngo ga-arụ ọrụ ha na kọnstituensi 24 dị n'Ebọnyị, dịka Inec natarala akwụkwọ njirimara ga-enyere ha aka ịgagharị ụbọchị ahụ. REC rịọkwara ndị ọrụngo a ka ha ghara iwe iwe maka akwụghị ụgwọ ha n'oge. Ọ gwara ha na ha ga-eji aka ha dee akara ụlọakụ ha maka ịgbalahụ ọgbatauhie akwụghị ụgwọ n'oge. Ọ malitere ịkpọpụta aha ha n'otu n'otu maka ime nke a nakwa ịgwa ha ebe ha ga-arụ ọrụ. N'ụbọchi ise nke ọnwa Maachị, ka ụlọọrụ inec kpọrọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ebọnyị steeti. Ndị pati 38 nakwa ndị otu na-abụghị nke gọọmenti bụ ndị ga-enyocha ka ya bụ ntuliaka nke a ga-eme na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị ga-esi gaa, bụ ndị nke dị iri (10) bịara ya bụ ọgbakọ. Inec Ebonyi Isiokwu Inec bụ na onweghi onye ọbụla ga-atụ vootu ụbọchị satọde na-ejighi igwe ""smartcard reader"". Inec sị na iwu a ga-akpụ okụ n'ọnụ n'ọgbọ a Mgbe ndị bịara ya bụ mkparitaụka jụrụ ajụjụ si, ""ọ bụrụ na ""smartcard reader"" arụghị ọrụ, gịnị ka a ga-eme?"", Inec zara sị na ndị ọrụ ha ga-ewete smartcard reader ọzọ were dochie nke mebiri emebi. ""Ọ bụrụ na nke ahụ ekweghi arụ ọrụ ahapụzịa ya ka ọ dịwa echi"". Inec sị na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ga-ahapụ ụlọọrụ ha ụbọchi Wenezde (Maachị 6) gawa ulọọrụ ha dị n'okpuruọchịchị dị icheiche, bụ ebe ha ga-esi gawa na RAC ha ụbọchị Fraịde. Chris Onugbogu nke ulọọru Inec Ebọnyị steeti sị na ""nke a ga-ewezuga ọgbatauhie pụrụ idapụta makana e mee ngwangwa, emeghara ọdachị."" Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-50807058,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50807058,"2019 Summary: Ntuliaka, mkpọrọ Orji Uzor Kalu na ihe ndị ọzọ kporo ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na 2019","Bido na ntuliaka iji họputa onyeisiala ruo na mkpọrọ a tụrụ aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu, Ị nwereike ikwu na afọ 2019 bụ chi bọọ a nụ ozo.","Lee ihe iri kachasi kpoo ọkụ: 1. Mwepụ Ọkaikpe ukwu Onnoghen Onyeisiala Muhammadu Buhari wepụrụ Walter Onnoghen dịka onyeisi ọkaikpe n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị. Buhari kwuru na ọ bụ maka ebubo nrụrụaka e boro Onnoghen kpatara o ji wepu ya n'ọkwa. 2. Mbugharịụbọchị ntuliaka Ka ọ fọrọ naanị elekere ole na ole ka oge ruo maka mbido ntuliaka 2019, Mahmood Yakubu bụ onyeisi INEC kwuru na e bugharịala ya bụ ntuliaka si n'abali iri na isii nke ọnwa Febrụwarị gaa abalị iri abụọ na atọ. Nke a tinyere onye ukwu na onye nta na gbagharia, ma mekwaa ka ndị mmadụ malite ikwu na ọ dị ka nrụrụaka abatala na ntuliaka ahụ. 3. Mmeri Buhari Mgbe Muhammadu Buhari pụtara ihe dịka onye meriri okwa onyeisiala, o mere ọtụtụ mmadu ndị n'ọchị ndị n'akwa. Atiku Abubakar bụ onye PDP kwuru na nnukwu nrụrụaka dị na ya bụ ntuliaka. Atiku gbara Buhari na ndị otu ya bụ 'All Progressives Congress' (APC) akwụkwọ n'ulọikpe, mana Buhari merikwara ya ebe ahụ. 4. Rochas, Nwosu na Ihedioha Uche Nwosu na Emeka Ihedioha gbara mgba ka dimkpa maka oche Govano Imo steeti, mana ọ bụ Ihedioha mechara merie. Nke a bụ n'agbanyeghi na Rochas Okorocha bụ aka na-achị Imo steeti oge ahụ dọnyeere Nwosu ukwu. Mana Rochas mechara zọta oche n'ụlọomeiwu ukwu n'agbanyeghi mgba ya na onwe ya gbara n'akụkụ nke ya maka oche ahụ. 5. Amaechi na Wike Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike na Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi gbara nnọọ mgba maka onye ga-emeri oche gọvanọ steeti ahụ. Ọ bụ ezie na Amaechi esoghi zọọ ya bụ ọkwa, mana ọ kwadoro Tonye Cole bụ onye otu ndọrọndọrọ 'Africa Progressives Congress' (APC). Nke a bụ n'ihi na INEC kụpụrụ ndi APC iso zoo ọchịchị na Rivas. Mana Wike meriri ma Amaechi ma Cole, kụọ ha abụọ ukwu n'ala. 6. Mwepụta ndị isi ụlọomeiwu Ahmed Lawan Onye ọbụla chị obi n'aka oge a na-akwado ntuliaka maka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Mana n'ikpeazụ, Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila tuuru ugo. Ike Ekweremadu so wee zọọ ya bu ọkwa, mana ọ chịtaghi aja. 7. Dino Melaye Ndị uweojii na-enyocha Dino maka ebubo gbasara ogbugbu mmadụ na ohi Dino Melaye kụrụ afọ n'ala na ndọrọndọrọ nke ndị otu PDP mere iji họputa onye ga-anọchite anya ha n'izọ ọkwa gọvanọ Kogi Steeti. Oteghi aka, ụlọikpe kagburu mmeri ya dịka onye omeiwu, ma kwuo ka e megharia ntuliaka ya. Mgbe e megharịrị ya, Melaye kụkwara afọ n'ala ọzọ wee ghọọ 'Aaron' gbara aka ala. 8. Nwụchi na mkpọrọ Sowore Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Ndị uweojii nzuzo bụ 'State Secret Service (SSS) nwụchiri Sowore n'ọnwa Ọgọstụ, ma tụọ ya mkpọrọ. Iwe ha bụ na Sowore chọrọ ịhazi ngaghariiwe a kpọrọ 'Revolution Now'. E mechara tọghapụ ya naanị otu ụbọchị tupu a nwụchie ya ọzọ. Sowore ka nọ na mkpọrọ ruo taa, agbanyeghi na ụlọikpe enyela iwu ugboro ugboro ka a tọhapụ ya. 9. Bọjeti 2020 Onyeisiala Buhari bugaara ndị omeiwu Bọjeti 2020. Ndị omeiwu mere ngwa ngwa itule ya bụ bọjeti ma kwado ya. Buhari binyere aka na bọjeti n'abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba. Nke a bu nke mbụ kemgbe afọ 1999 onyeisiala na-ebinye aka na bọjeti n'ọnwa Disemba nke ga-eme ka ọ malite kpọmkwem n'abalị mbụ nke Jenụwarị. 10. Mkpọrọ Orji Uzor Kalu Ụlọikpe dị na Legọs mara OUK ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ. Nke a gbara ọtụtụ mmadụ gharịị n'ihi na Kalu bụ onye otu All Progressives Congress (APC) bụ Pati nọ n'ochịchị. Ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kwukwara na ọtụtụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka na-agabiga nnyocha. Ka anyị chebiri afọ 2020 makana ọ dị ime! Onye ma nke ndọrọndọrọ ọchịchị ga-amụta? Akụkọ ndị ga-amasị gị Ndụmọdụ onye Igbo ọbụla ga-achọ ịnụ" 54393177,https://www.bbc.com/igbo/54393177,Igbo culture: Ụzọ isii ndị Igbo si ekpezi esemokwu oge gboo,"Mgbe ọbụla mmadụ maọbụ obodo na ibe ya na-enwe mmekọrịta, esemokwu nwere ike ịdapụta n'ihi ndiiche n'echiche onye na ihe onye na-achọ mana ọ bụ e lee, a ghara ka di na nwunye ji ebi.","Igbo nwere ụzọ dị iche iche e si edozi esemokwu maọbụ nghọtahie n'etiti di na nwunye, nwanne na nwanne, ezinaụlo na ezinaụlọ, ụmụnna na ụmụnna, otu na otu, maọbụ obodo na obodo. Ofalla ala Igbo Otu onye ihe omenala doro anya bụ Durueke Ngwangene bunyere anyị uche etu ndị nna ochie si eme ya. Lee ụfọdụ ụzọ ndị gboo si edozi esemokwu dịka o siri rụtụ aka: 1. Ịṅụ iyi Iyi bụ mmadụ iji ihe karịrị ya kwe nkwa maọbụ gọrọ onwe ya na aka ya dị ọcha maọbụ na ihe a na-ebo ya abụghị eziokwu maọbụ na ọ bụ. A na-aṅụ iyi n'esemokwu dịka ịzọ ala maọbụ nnukwu ebubo. Nke a na-emekarị oge ndị ọzọ etinyechala ọnụ n'okwu ahụ mana edoziteghị ya. A na-aṅụ iyi n'arụsị, obi, maọbụ n'ala ndị ichie. Nwangene kwuru na a na-ekwubi okwu ihe ga-eme onye aka ya adịghị ọcha ma a na-aṅụ iyi. Ọ gara n'ihu gbaa akaebe maka ihe mere oge ọ dị na nwata sị, ""Ahụla m onye e mere otu a, ala tigbuo ya."" 2. Igba ndụ Ịgba ndụ bụ ikwe nkwa na ịgaghị eme ibe gị ihe ọjọọ. A na-eji ihe dị icheiche agba ndụ. Ụfọdụ na-eji nri agba ndụ. Ụfọdụ, mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n'anya na-eji ọbara agba ndụ iji hụ na otu onye agaghị agbahapụ ibe ya. Mba na mba na-agba ndụ. Ndị nọ n'otu na-agbakwa ndụ. Iji maa atụ, otu mmọnwụ iji chekwa ihe nzuzo dị n'etiti ha. Otu dịga iche iche na-agba ndụ. Ọmụmaatụ, ndị nze na-agba ndụ na ị gaghị eme ụfọdụ ihe dịka; ị gaghị atụ asị, ị gaghị ezu ohi, ị gaghị awakpo nwaanyị n'ike wdg. Nwangene kwuru sị, ""A na-eji ihe dịka uriom ọkụkọ maọbụ okpete saa onye ahụ ire."" ""Ịgbachaa ndụ ahụ, ị gaghị na-ekwu okwu etu ọbụla."" 3. Ilu na ụkabụilu Ilu bụ mmanụ ndị Igbo ji eri okwu; nke a bụ ụkabụilu a ma ama. Mana ị matara na ilu bụkwa mmiri na-amari esemokwu? Ndị Igbo sị na ọ bụ ire ọma ka eju ji aga n'ogwu. Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo N'ala Igbo, a na-eji ilu akpọdata ndị obi ha lara elu n'ihi esemokwu site na ime ka ha chebaa echiche ime, ma kpee udo. Lee ụfọdụ ilu ndị bụ igodo Igbo ji agbape ụzọ esemokwu gbachiri: a. ""Ọfọ ka ide ji awa ala."" b. ""Ire Ọma ga-ejula ji aga n'ogwu."" ch. ""Hapu ihe niile tara n'abali ka ọ bụrụ anwụ."" 4. Orikọ O nwere ụdị esemokwu e nwere ike inwe, e sie nri rikọ were dozie ya bụ okwu. Dịka Dureke Nwangene siri kọwaa, a na-akpọ ya ""akanọkụ' maọbụ ""orikọ."" ""Ọ naghị ahịa ahụ o gbuo mmadụ n'ihi na a na-ekwubi okwu tupu e rikọọ ya."" A na-ekwubi okwu tupu erie nri ahụ nye ọmụma atụ, a na-eme ụdị oriri a n'alụm nwaanyị. A na-eji ewu mee ya, ya bụ ịgba iyi na ị gaghị eme ibe gị ihe ọjọọ. 5. Ihe onyinye N'ala Igbo oge gboo, a na-eji ihe ubi, ego, ala, anụmanụ maọbụ mmadụ nye onyinye iji dozi esemokwu. A na-eme nke a n'esemokwu dị n'etiti mmadụ na mmadụ ibe ya maọbụ obodo na obodo. Chinua Achebe n'akwụkwọ ya ọ kpọrọ 'Things Fall Apart' kọrọ akụkọ etu ndị obodo Mbaino siri nye ndị Ụmụọfịa onyinye otu nwa nwoke gbara afọ iri na ise a kpọrọ Ikemefuna. Nke a bụ iji dozie okwu pụtara ka ha gbuchara otu nwaanyị onye Ụmụọfịa were si etu ahụ gbalahụ ha na ndị Ụmụọfịa ịlụ agha. Dịka Nwangene siri kọwaa n'ala Igbo, ""Isi na Isi na-ala. I gbuhaala mmadụ n'ala Igbo, ihe ị ga-eji mechie ya bụ mmadụ."" 6. Ịjụ ese Mgbe ụfọdụ ekpewe ikpe n'ime ụlọ maọbụ n'ama mana ekpesiteghị ya, e nweere ị ga-arụsị maọbụ na nke nwa dibịa ụjụ ese. Dịka Nwangene si kọwaa, n'ihe gbasara esemokwu ala, ""a na-eje n'arụsị maọbụ gbaa afa iji mata nke bụ eziokwu."" Igbo Language: Gịnị bụ 'Blue' n'asụsụ Igbo? Kedụ ndị na-ekpezi esemokwu n'ala Igbo? Ụmụada o na ndị na-ekpezi esemokwu n'ala Igbo Ndị ọrụ ha bụ idozi okwu n'ala Igbo gụnyere: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43123750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43123750,Emmanuella: Ụlọ a m rụrụ bụ nke nne m na nna m,Ọtụtụ ndị ama ama bụ ụkpa ekele ebunye ọkpaọchị Emmanuella dịka ọ rụtara nne ya ụlọ.,"Ọkpaọchị a dị afọ iri wepụtara foto ụlọ ọhụrụ ọ rụrụ nne ya n'ụbọchị Fraịde. End of Instagram post, 1 N'okwu ya, ´a rụrụ m nne m ụlọ a , maka ekpere, nkwado, ọ na-enye m. Nne m, a ma m na ịchọrọ ụlọ dị pichọ pịchọ, lee ya ebe a. ""Mana gbaghara m makana m ga-arụcharịrị gị ụlọ ukwu gị n'afọ na-abịanụ."" Nne Emmanuella egbughị oge n'igosi oke ọnụ ya dịka ọ nọ na-elegharị anya n'ụlọ ahụ e doziri nke ọma. 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ' Lee ihe ise ị na maghị maka Emmanuella Nwata nwanyị bụ Emmanuella Samuel bụ onye a ga-eji maatụ ilu sị na 'nwata kwọ aka, o soro okenye rie nri'. Akụkọ n'ekwụ na ọ banyere ihe onyonyo ndị Walt Disney na Hollywood. Ọ sị na-ịme ihe na-akpa ọchị n'onyonyo we rue ebe ahụ. Ka ude ya n'ede, anyị ga-ewetara gị ịhe ise ị maghị maka nwata nwanyị a pụrụ ịche. Amụrụ ya n'afọ 2010 Emmanuella bụ nwa afọ Imo steetị amụrụ n'bodo PortHacourt na Rivers steeti: O nwere ihe karịrị mmadụ otu nde na-elele ihe onyonyo ya Ọ ga-agba afọ asatọ n'ọnwa Julai: N'agbanyeghị afọ ya, o ritela ntuliugo asaa maka ime ihe na-akpa ọchị. Ọ bụ nwata na-emepụta ihe ọchị Nwanne ya nwoke bụ onye akpaọchị amaama: Ọ bụ n'elu ọkwa nwanne ya bụ 'Mark Angel Comedy' ka o si bido ịmepụta ịhe ọchị nke ya. Nwata nwanyị ahụ na nwanne ya nwoke bụ Mark Angel O ritela ezigbo ego! Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise. Nwata kwọ aka, o soro okenye rịe nrị Ihe onyonyo njiri mara ya bụ 'My Real Face' Lee kwa ya eba: Onyeịsị ụlọ omeiwu Sinetị bụ Bukola Saraki ezịgara la ya ozi ya bịa n'ụlọọrụ Sineti nara nkwanye ugwu." afirika-45044213,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45044213,Eunice Atuejide ọ gbaala onwe ya egbe n'ụkwụ?,Otu nwaanyị na-apụta ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala bụ Eunice Atuejide na-enweta ọkụ ugbua dịka aha ya na-ewu maka okwu 'feminism'.,"Eunice kwupụtara n'akara Twitter ya na ya abụghị 'feministi' ma ncha. End of Twitter post, 1 N'okwu ya, ""Abụghị m feministi! Nwaanyị anaghị esiri di ya nri? Ụmụnwaanyị na-akparị ụmụnwoke maka na ọ masịrị ha?"" Ọtụtụ mmadụ anabataghị okwu a okwuru, ha bidoro ịkatọ ya. @OlayinkaFO1 kwuru na ọ bụ ihe mwute na nwaanyị dịka ya aghọtaghị ihe feminism pụtara. @NaijaFlyingDr kwukwara na ozi ya gosiri na ọ ghọtaghị ihe bụ feminism. @Allyshimmer kwuru na ịbụ feminism bụ nwaanyị ịnwe ohere ị họrọ ihe ọ chọrọ ị bụ na ndụ ya. Chimamanda akọwapụtala onye ""feministị"" bụ Mana ọ bụghị onye ọbụla katọrọ ya, @KingDavidJasper kwuru na ndị mmadụ aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. ...Mana ọ dịghị ka ihe ndị a emetụrụ Eunice, lee ihe o kwuru maka ihe a na-eme." afirika-43194328,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43194328,Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada,Otu nwoke a na-akpọ Stephen Nnadiogo dị afọ iri anọ na asatọ ka ndị ntaakụkọ na-akọwa na o gburu ọchụ na Ntueke Street nke dị n'Awada Obosi.,"Nnadiogo ji mma gbuo ụmụ anọ ya na nwata ya na ha bi, tupu o gbuo onwe ya. Ụmụaka ya dị afọ abụọ ruo afọ iri, ebe nwata nwaanyi ahụ a na-akpọ ọgechi dị afọ iri na asatọ. Nnadiogo bụ onye Isu Njaba nke di n'Imo steeti. Ụlọ ntaakụkọ Punch nke Naịjirịa sị na Nnadiogo na nwunye ya bu Chika Nnadiogo dị afọ iri atọ na abụọ na-enwe nsogbu n'ụlọ ha. Ha gakwara n'iru kọwa na Nnadiogo boro nwunye ya ebubo na ọ na-agba n'ezi. Ndị ma maka ezinụlọ a kwuputara na Chika na-agwa di ya na ọ bụghị ya mụrụ ụmụ ha ma ha na-ese okwu. Punch kwuru na otu onye hụrụ mgbe ihe a mere sịrị na ọ bụ mgbe Chika gara ebe ọ na-ere ọgwụ na mgbede ka arụ ahụ mere. ""Chika sịrị na ya na-agba n'ezi maka di ya abụghị nwoke. Chika na-akpọ kwa nwunye ya akwụna otu nwoke adịghị ezuru,"" Onye akaegbe a kwuru. Ọ gakwara n'ihu we sị na ka Nnadiogo gbuchara ụmụ ya, ọ kpọchiri onwe ya n'ime ụlọ ha wee ṅụọ nshi ọnụ gburu ya. Onyeisi na ụlọọrụ uweojii n'Awada bụ Martin Mbajunwa kwuru na ihe a mere, na-akọwa na ha nọ na eme nyocha ugbua. Ọ sị na egbugala ozu ndị nwụrụ na ebe ana busa ozu. BBC Igbo gbara onye na-ekwuchịtere ndi uweojii n'Anambra bụ Nkeiruka Nwode ajụjụ maka ihe mere o wee sị na ọrịakụ Nnadiogo di mma, na ha na ya kwuru okwu taa. Ma na asikwa na ha na eche ka emecha nchọpụta maka ihe a mere. Gee okwu ebe a: Ihe uweojii Anambra kwuru maka onye gburu ụmụ ya Ndị ụweojii na-ekwu na ọ ga abụ na Nnadiogo ṅụrụ ọgwụ ike, ma sị na ọ ndị ọlụọgwụ weta nchọpụta ha ka aga ama nke bu eziokwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45032444,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45032444,Tambuwal efeerela APC aka,"Dịka aka na-achị Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal kwuputara na ọ gbaghapụla APC banye PDP, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tụmadị ndị nọ na PDP na-eto nzọpụ ụkwụ ya.","Tambuwal nọbu na PDP si ya gafee APC Ozi pụtara na Tambuwal hapụrụ APC taa gawa PDP. Tambuwal onye kwuputara nke a na Twitter ya, kwuru na-ya na ndị Sokoto kpara ya akpa. End of Twitter post, 1 Ọtụtụ ndị Sokoto pụtara n'igwe oge o mere nkwuputa ya. Nke a na-eme ya gọvanọ atọ na-esi APC apụ. Abalị ole na ole gara aga, Abdulfah Ahmed nke Kwara steeti nakwa Sam Ortom nke Benue steeti hapụrụ otu APC. Ndị ụlọomeiwu etiti ruru mmadụ iri ise hapụkwara otu APC banye PDP maọbụ ADC. Ihe ndị mmadụ na-ekwu N'okwu ya, Ayo Fayose nabatara Tambuwal na PDP ma kwuo na ha ga-ejikọ aka ọnụ zọpụta Naijiria n'aka ndị ọchịchị nchịgbu. Ụfọdụ ndị Naijiria na-akwa gọọmentị emu sị na ha ga-ebido ugbua chetara ya njọ o mere oge gara aga. Dipọ Awojide mara amụma na oge na-adịghị anya, EFCC ga-echeta na Gọvanọ Tambuwal zuru mkpịsịodee n'afọ 1994, ma mepere ya akwụkwọ ikpe ya ugbua. @SmithVinci kwukwara n'otu olu ahụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50298983,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50298983,Border Closure: Ihe 10 Naịjirịa nwereike ịmepụta a ka na-esi mba ọzọ atụbata,"Dịka gọọmenti etiti wepụtachara ihe ndị ga-eme ka ha agbape 'bọda', anyị na-ewepụta ihe iri Naịjirịa ka na-atụbata mana ha nwereike emepụtali na bee ha.","Ha karịrị iri mana anyị ga-agbado ụkwụ na nanị iri. Nke mbụ bụ azụ okporoko Naịjirịa nwere azụ dị icheiche mana ndị mmadụ ka na-ajụ ihe na-atọ ha iche n'okporoko tụmadị isi ya. Naanị n'ọnwa 2017 ka mba Norway depụtara na Naịjirịa zụrụ ha ahịa ruru nde iri ise n'ụma nke mere ka ọ bụrụ mba kachasị atụbata azụ na mba ụwa niile. Nke abụọ bụ okpu nnabuenyi nke akpọrọ Kondom n'asụsụ bekee Society for Family Health Nigeria kwuru na ndị Naịjirịa na-eji ihe ruru Kondom nde narị anọ(400million) eme ihe kwa afọ. Mana mgbe onyeisi ngalaba ahụ bụ Bright Ekweremadu kwuputechara ọnụ ọgụ a, ndị mmadụ kwuru na o nwereike ịkarị ole ahụ. Nke atọ bụ ntutu ụmụnwaanyị Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ọ na-amasị ikpu ntutu ndị ọcha n'isi ha. A na-esicha China , India nakwa Peru atụbata ya bụ ntutu na Naịjirịa. Nke anọ bụ nkpapụta eze National Bureau of Statistics na-ekwu na Naịjirịa mefuru ego ruru naira nde iri na otu na ụma(N11.46m) n'afọ 2016. Agbanyeghị na gọọmenti etiti akachapụchala ya na ụfọdụ ihe eji ego ofesi azụta , ndị mmadụ ka na atụbata ya. Gọọmenti etiti na-ekwusi ike na a ga-emepụtali ya bụ npkafụta eze na Naịjirịa. Nke ise bụ mmanụ nri na mmanụ ọpụpa Nke isi bụ ude na ncha Nke asaa bụ peteri na akpa ara. Nke asatọ bụ kọmpụta na ekwenti Nke itoolu bụ akwa a na-eyi n'ahụ Nke iri bụ ụgbọala Mana etu a emechirila oke ala, ndị mmadụ na-ele anya ịhụ ka ụmụ Naịjirịa bido rụpụtawa ụmụ ihe a na-atụbata n'obodo a enwereike ịrụpụtalị na ya. Akụkọ ga-amasị gị Free education: Nwoke na-azụ ụmụaka 1000 n'akwụkwọ n'efu n'Aba" afirika-44009400,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44009400,Ndị uweojii mere ngagharị iwe n'ụlọọrụ onye na-agụkọta ego Naịjiria,Ndị uweoji a gaala n'isi ụlọọrụ onye na-agụkọta ego Naịjirịa ị me ngagharị iwe maka ị mapụ ego na akwụghị ụgwọ ọnwa ha n'Abuja taa.,"Ụlọọrụ ebe ndị uweojii ahụ gara ngagharị ịwe Ihe ha na-ekwu butere nsogbu a bụ usoro ọhụrụ etinyere iji kwụ ha ụgwọ a kpọrọ IPPS n'aha ịchafụ. Ụfọdụ n'ime ha anatabeghị ụgwọ ọnwa cha cha kemgbe ọnwa anọ ebe amapụrụ ego n'ụgwọ ndị ọzọ. IPPS bụ ụsoro ọhụrụ gọọmentị etiti bubatara kemgbe afọ 2017 iji kwụ ndị ọrụ gọọmentị niile ụgwọ ọnwa maka ị benata mpụ na ozuzu ego. Otu onye uweojii achọghị ka-enye aha ya kwuru na ihe a metụtara ya na nwunye ya ruru ọkwa Sajentị n'ọrụ uweojii. Ọ sị na nwụnye ya anatabeghị ụgwọ ọnwa zuru oke kemgbe ọnwa Febụrụwarị. Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a: Okwu ụgwọ ọnwa ndi ụweojii Onye na-ekwuchitere ndị uweojii n'ihe gbasara mmekọ ha na ndị ọzọ bụ Jimoh Moshood kwuru na ha ga-ahazị nsogbu a n'oge adịghị anya. N'ime akwụkwọ o depụtara, Moshood kwuru na ọ bụ nzọhie ngwa ọrụ ha kpatara nke a. N'ọnụ ya ""Ndị niile ihe a metụtara ga-enweta ego ha n'agafeghị ụbọchị asaa nke mee"" Ụfọdụ ndị uweojii nọ n'ebe ha gara ngagharị iwe Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47509437,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47509437,Governorship Election 2019: Kedụzịa ndị tụrụ vootu n'izuụka abụọ gara aga?,"Dịka a na-eme ntulika nke ọkwa Gọvanọ na nke ụlọomeiwu steeti dị icheiche, ihe dị iche dị.","Ndị ntaakụko BBC n'ebe niile n'ala Igbo na-ajụ otu ajụjụ; ndị mmadụ apụtaghị mee ntuliaka. N'ụfọdụ ebe, ndị mmadụ apụtaghị chacha, n'ebe ndị ọzọ mmadụ ole na ole pụtara ime ya bụ ntuliaka. Ndị ọrụ ngo Inec na-enweta onwe ha dịka ndị mmadụ apụtaghị ịtụ vootu N'Enugwu, ndị ntoroọbia gbaghapụrụ ntuliaka ịga gbaa bọọlụ na egwuregwu ndị ọzọ Ntuliaka anaghị atọ ndị a dịka bọọlụ Ọ bụkwa ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'Igwe soshal midia dị icheiche. Iyke kwuru na ọ bụ makana ndị mmadụ enweghizi olileanya na ngalaba Inec. Emeka bi na Yaba, Legọs kwuru na onweghi ndị a hụrụ anya cha cha. Ebe Imoh na-akọwa ahụmihe ya n'ọgbọ ntuliaka ya . Nke mere na ụfọdụ ndị a ma ama dịka Ramsey Nouah tinyere ọnụ n'okwu a. Ọ bụ okwu ego? Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka na enweghi ego a na-ekesa nadị mmadụ dịka e mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala." afirika-51935658,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51935658,Actors Guild of Nigeria: Ime Sịnetọ Abbo 'patron' dịka ibute nsị n'ime ụlọ - Ụmụnwaanyị Nollywood,Ụfọdụ ndị na-eme ihe nkiri ọkachasị ụmụnwaanyị agbarụọla ihu etu ndịisi otu jikọrọ ndị na-eme ihe nkiri bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) ji mee Sịnetọ Elisha Abbo papa ukwu ha.,"Nke a dị n'ihe onyonyo nakwa ihe ha depụtara n'akara soshal midia ha bụ ebe ha gbarụrụ ihe maka nke a. Hilda Dokubo gọsịpụtara iwe site n'ihe onyonyo dị n'akara twitter nke mere BBC Igbo ji gbaa ya ajụjụọnụ iji maka ihe bụ iwe ya. Dokubo gwara BBC sị na sịnetọ Abbo etozughi oke ịnata ọkwa ahụ maka agwa ọjọọ ọ kpasoro otu nwaanyị n'Abuja n'afọ 2019. Ọ sị na ọ bụ otu sịnetọ a bụ onye tiri nwaagbọghọ ihe n'ụlọahịa dị n'Abuja na-arịọghị mgbaghara n'ụzọ kwesịrị. Ọ gara n'ihu kwuo na ime Sịnetọ Abbo Papa ukwu n'AGN dịka ibute nsị n'ime ụlọ. Hilda sị na nke ka nke bụ na ndịisi ha emeghi ka ọtụtụ n'ime mara tupu e nye sịnetọ Abbo ọkwa ahụ. Elisha Abbo: Etiri m ya ihe iji bọọ ihe o tiri nwanne m nwaanyị N'otu aka ahụ nwaanyị ọzọ na-eme ihe nkiri bụ Kate Henshaw tinyere ọnụ ya n'okwu a site n'akara Twitter ya. O kwuru na Elisha Abbo etorughi ịbụ papa ukwu n'otu AGN, ka ọ ghara ịma ụmụnwaanyị akantị. Mana onyeisi otu AGN bụ Emeka Rollas zaghachịrị ndị a site n'ajụjụọnụ ụlọọrụ ntaakụkọ Pulsetv gbara ya. Emeka sị na Abbo arịọla mgbaghara maka ịma nwaanyị ụra, na ọ dịghị ndị AGN n'aka ikpe ya ikpe. Ọ gara n'ihu kwuo na odoghi ya anya ma Hilda na Kate ha so n'otu AGN, na ọ ga-eleba anya n'akwụkwọ ka ọ mara" afirika-46407662,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46407662,Nigeria Election 2019: Ụzọ iri ị ga-eji abụ onyeisiala Naịjirịa,Ọrụ onyeisiala bụ ọrụ kachasị dị mkpa ma kachasị nwee ikike na Naịjirịa.,"Nigerian President: Usoro e ji abụ Onyeisiala Naijiria A na-asị na Onye isiala Naịjirịa nwere ikikere ọchịchị karịa onye isiala ọtụtụ mba ndị ọzọ, nke a mere ọkwa a ji adọ akpịrị. Ya mere onye chọrọ ịbụ onye isiala kwesịrị ịkwado nke ọma ma mara kwa ụzọ ọ ga-eji merie. Akụkọ a na-arụtụ aka n'usoro mmadụ nwere ike iji bụrụ onye isiala Naịjirịa n'oge na-adịghị anya. Akụrụngwa iji bụrụ Onyeisiala Naịjirịa: Onye ọbụla chọrọ ịbụ onye isiala Naịjirịa ga-enweriri akụrụ ngwa ndị a; Ịbụ nwafọ mba Naịjirịa Njirimaara Naịjirịa Tupu ị bụrụ onye isiala Naịjirịa, Ị ga-abụ nwafọ Naịjirịa site n'ọmụmụ. Iwu kwuru na onye ahụ agaghị abụ nwafọ mba ọzọ ka ọ ghara inwe nkwenye na mba abụọ. Afọ ole ị gbara Afọ kachasị obere iji abụ onyeisiala bụ afọ iri atọ na ise (35). Nke mere na onye ruru afọ iri atọ tozuruoke ịzọ ọkwa onyeisiala. Ogogo agụmakwụkwọ Ogogo agụmakwụkwọ eji a bụ onyeisiala bụ naanị asambodo ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Anaghị akpụ asambodo akpụ, a ga-akwụsị onye mere nke a ịzọ ọkwa a. Ndịisiala Naịjirịa site n'afọ 1999 ruo afọ 2019 Otu ndọrọ ndọrọ N'agbanyeghi ikike niile n'eso ọkwa onyeisiala, ọ ghaghị ịbụ onye ahọpụtara site n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ịbụ onye otu n'ime ha. Ọrụ Tupu mmadụ e tozuo oke ịzọ ọkwa onyeisiala, onye ahụ ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ọha na-eze ọbụla ọ n'arụ. Ọ ga-eme nke a ma ọfọdụ ihe dịka otu ọnwa tupu a na-eme ntụliaka. Isi izuoke Onweghi mba ga-achọ ka onyeisiala na-enweghi ezi akọ na uche na-chị ya, ya mere ị ga-abụ onye isi na-ahụ zuru oke dịka iwu na-achị Naịjirịa si kwuo. Ị gaghị enwe akụkọ ime mpụ Onye isiala Naịjirịa agaghị enwe akụkọ ime mpụ ọbụla n'ihe banyere emeghi ihe n'eziokwu maọbụ ịkpa agwa aghụghọ. Ọnọdụ ego Ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala ekwesighị ibụ onye ego kọrọ n'akpa maọbụ n'ụlọ akụ ya dịka iwu na-achị Naịjirịa siri dị. Otu nzuzo Onye na-azọ ọkwa onyeisiala agaghị abụ onye otu nzuzo ọbụla na Naịjirịa nakwa mba ofesi. Nzọụkwụ iji tozuo oke n'ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa. E nwere ihe ruru otu ndọrọndọrọ ọchịchị iri itoolu na otu na Naịjirịa ugbua Iwu kwuru na onweghi onye ọbụla ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala ma ọ bụrụ na o soyeghi n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a maara aha ya. I kwesiri ịba n'ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na Naịjirịa. Ị ga-aga debanye aha na wọọdụ ebe isi pụta, ebe ibi maọbụ ebe ị na-arụ ọrụ. Ndị otu ahụ ga-anabata gị n'uche nke ha ma nye gị akwụkwọ ga-egosi na ịbụ onye otu ahụ. Ọ bụrụ na anabata gị n'ime otu ndọrọ ndọrọ. Ị ga-ekwupụta uche gị nye ndị ndu otu ahụ na ị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ka ha nwee ike họpụta. N'iji mee nke ọma dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala, i kwesiri inwe otu kpọrọ akpọ ga-achụrụ gị nta vootu. Ndị otu a ga-enwe onyeisioche, onye odeakwụkwọ, onye odeakwụkwọ ego nakwa onye na-agụkọ ego. Ọsọ achụnta vootu ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Dịka ihiwechara otu achụnta vootu gị, ihe ọzọ bụ ịmalite ọsọ achụmnta vootu. Ọsọ achụmnta vootu nke onyeisiala kwesiri ka a gbaa ya na steeti niile dị na mba ahụ. Ị ga-akpọtụrụ ndị ndu ọdịnala, ndị ndu ụka nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ọbụla. Ị ga-agwa ha uche gị n'ịzọ ọkwa onyeisiala ma rịọ maka nkwado ha. Independent National Electoral Commission (INEC) bụ ụlọọrụ na-ahazị ntụliaka na Naịjirịa Adala mba dịka i mechara njem ileta ndị i kwesịrị ileta. Ọsọ achụmnta vootu gị ekwesighi ịkwụsị rue oge a ga-eme ntuliaka ahụ. Ndị otu achụnta vootu gị ga-esochi ntuliaka iji hụụ na-emere ihe niile n'ụzọ ziri ezi n'enweghi nrụrụaka ọbụla. I soro nzọụkwụ ndị a, i kwesịrị ịhụta onwe gị n'ọkwa onyeisiala nke Naịjirịa." afirika-46417554,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46417554,Child brides: Naịjirịa nwere ụmụada ụmụaka nde 23 ekenyere di na erughi eru,"Agbanyeghi na ụmụada ịlụ di n'erughi opekata mpe afọ 18 na-ebute ọtụtụ nsogbu ahụike na mwulite ezinaụlọ, ọtụtụ ezinaụlọ na-aga n'ihu ikenye nwa ha di n'erughi eru.","Dịka otu mbaụwa nke a kpọrọ United Nations na bekee siri kwuo, ụmụada ụmụ Naịjirịa alụruola di nde iri abụọ na atọ (23million). Ọnụọgụgụgụ a mere Naijiria mba kachasị nwe ụmụada lụrụla di erubeghị eru a kwanyere n'ịlụ di na nwata. Onye ọrụ mgbasasaozi otu UN bụ Dọkịta Seyi Soremekun kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o depụtara n'ụbọchị Satode. Kedụ ọghọm dị n'ikenye nwata di? Dịka dịbịa ahụike ụmụnwaanyị bụ Dọkịta (Sr) Paschalina Ezechukwu siri kọọwa, ọtụtụ ọghọm dị na nwada nwata ịlụ di. Nke a bụ n'ihi na dịka Ezechukwu, onye na-arụ n'ụlọọgwu Mother of Christ, Enugwu, siri kọwa, ọkpụkpụ ukwu ya esibeghị ike. Ọghọ m ndị ahụ gụnyere: 1. Ihe ọdịdọ nke a kpọrọ 'pre-emclampsia' maọbụ 'emclampsia' na bekee na-akarị n'ụmụada etorughi etoru n'ịtụrụ ime. 2. O nwereike inwe nsogbu bụ anaghị anyụnwụ mmamiri site na ọwara kwesịrị nke a kpọrọ VVF. 3. Ọ na-ebute ime omume ịnọte aka tupu a mụọ nwa nke n'ụfọdụ oge a waa nwaanyị afọ iji kupụta nwa. 4. Ụfọdụ agaghị ama etu esi eleta nwa ha mụrụ ọhụrụ. Gee ihe Dọkịta Ezechukwu kwuru n'uju: Dr Ezechukwu: Ọghọm dị na erughị eru alụ di Ihe mere ndị mmadụ ji ekenye nwata nwaanyị di n'etorughi etoru? Mana ndị mmadụ nwere isi okwu kpatara ha ji ekenye maọbụ lụọ nwa ada erubeghi eru. Lee ụfọdụ n'ime ha: I. Ụmụnwoke na-achọ nwa ada na-amabeghi nwoke Na nkọwa ya, otu nwoke a kpọọ Kenneth Eze kwuru na ""O nwere ụmụnwoke na-achọ ụzọ n'enweghi onye garala ya."" 2. Iji gbalahụ ime ọkwa Eze gara n'ihu kwuo sị ""Nne na nna chọpụta na anya nwa ha nwaanyị dị na nwoke, kama ọ ga-emebi, ha emechie anya n'ihu kenye ya di."" 3. Ụbịam na enweghi nghọta N'okwu ya, Patrick Osuji gwara BBC Igbo na ụfọdụ ụmụnwoke na-alụ ndị dị otu a ji nweta onye ha ga-agbazinwuru. Akụkọ ga-amasi gị:" afirika-57333259,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57333259,"Lai Mohammed: Twitter na-eme ihụ abụọ, gịnị kpatara na ha ewepụbeghị ọtụtụ ihe Nnamdi Kanu na-ede?",Gọọmentị Etiti ebola ụlọọrụ Twitter ebubo ime ihu abụọ maka iwepụ ozi onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara n'akara Twitter ya.,"Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Lai Mohammed kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde, ma kwuo na ọtụtụ ihe Nnamdi Kanu na-ede, Twitter hapụrụ ya. End of Twitter post, 1 O kwuru sị: ""Anyị na-enyo Twitter enyo n'obodo a bụ Naịjirịa. Ọrụ ha na Naịjirịa edochabeghị anya."" ""Ị hụtụla ebe Twitter wepụrụ ihe Nnamdi Kanu dere, n'agbanyeghị na okwu ya nwere ike ibute ọgbaaghara."" ""N'oge End SARS, Twitter ji ego ha na-akwado ndị End Sars."" ""Otu ihe mere n'oge End Sars bụkwa ihe mere na mba Amerịka mana Twitter ji ọsọ machie Donald Trump, mana enweghị ihe ha mere ndị End SARS."" ""Anyị agaghị ekwe ka onye ọbụla ghọgbuo anyị, ọrụ anyị bụ ịchị obodo a, anyị ga-achịkwanụ ya etu ike kwere anyị."" ""Twitter bụ ndị ihu abụọ. O nweghị ebe ọbụla n'ụwa mmadụ ga-anọ na abụghị Naijiria ebe mmadụ ga-enye ndị otu ya ikike imegide ikikere ọchịchị; uweojii, ndị agha, ọkachasị ọ bụrụ otu a machiri amachị."" Buhari Tweets: M.I, Ill Bliss, Johnny Drille na ndị ọzọ ama ama sị na ""IamIgbotoo"" M.I Abaga, IllBliss, Johnny Drille Ọtụtụ ndị otiegwu, ndị ome ejije, na ndị ọzọ a ma ama na Naịjirịa ka na-akatọkwa Onyeisiala Buhari maka okwu ya gbasara iji aka ike soro ndị ndị na-azọ nnwereonwe Biafra. Ha gụnyere Jude Abaga, onye e ji M.I mara, Johnny Drille, Ill Bliss, na ndị ọzọ. Okwu ha na-ekwu na Twitter mere ka #iamigbotoo malite iwu dịka ọtụtụ na-ekwu na mmegbu ndị Igbo na Naịjirịa akarịala Gịnị bulitere nke a? Ọ bụ M.I malitere ya bụ okwu dịka o mere onyonyo ebe ọ nọ katọọ ihe Onyeisiala Buhari kwuru ma kwuo na ya kwụ ndị Igbo n'azụ. M.I kwuru sị: ""Onweghị onye Igbo ọbụla nụrụ ihe Onyeisiala kwuru ka obi ghara ịlọ ya mmiri nke ukwuu."" ""Ya mere o ji dị mkpa na anyị niile, ma ndị Igbo ma ndị abụghị ndị Igbo, ga-ejikọ aka ọnụ kwuo na anyị akwadoghị ihe ahụ Onyeisiala kwuru."" ""Ọ ga-adị mma ka onye ọbụla tinye ọnụ ma gwa ndị Igbo na anyị niile bụ otu, anyị hụrụ ha n'anya, anyị agaghị ekwe ka ihe mere n'oge gara aga kewaa anyị. Na nzaghachi ihe ahụ M.I kwuru, Kate Henshaw, onye na-eme ejije Nollywood, tinyere akara onye na-akụ aka nke gosiri na ọ kwadoro ya bụ okwu N'aka nke ya, Johnny Drille kwuru na ndị Igbo bụ agbụrụ nwere obi ọma dịka o si chọpụta oge o ji otu afọ fee ala Naịjirịa n'Enugwu steeti. O kwukwara na ọtụtụ ndị Igbo na-akwado egwu ya ma bụrụkwa ndị nwere obi ọma. Ill Bliss, onye oti egwu ọzọ a ma ama kwuru na ihe na-eme ugbua n'ala Igbo jọrọ njọ. O kwuru na o kwesịrị ka ndị Igbo niile a ma ama soro were olu ha kwuo okwu ma katọọ ya bụ ihe. Twitter ewepụla ozi Buhari dere maka iji aka ike soo ndị na-eti mkpu nnwereonwe Ụlọọrụ Twitter ewepụla ozi Onyeisiala Muhammadu Buhari gbasara n'akara Twitter ya n'ụbọchị Tuzde gbasara ndị o kwuru na-emebisi ihe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. Twitter na-ekwu na ihe ahụ Buhari dere megidere iwu ha, dịka ọtụtụ ndị mmadụ wetaara ha mkpesa gbasara ozi ahụ. Twitter kwuru na ihe ahụ Buhari dere megidere iwu ha Gịnị mere Twitter ji wepụ ozi Buhari? Ihe nwere ike ime ka Twitter wepu ozi mmadụ maọbụ wepụ akara Twitter mmadụ Ihe bụ isi sekpụ nti n'ihe ahụ Buhari dere bụ ebe o kwuru na ha bụ ndị so lụọ agha ọnwa iri atọ, ga-emeso ndị na-emebi ihe na Naịjirịa omume ""n'asụsụ ha ga-aghọta"". Ndị mmadụ kwuru na nke a dịka Buhari ịchị ndị Igbo ọchị maka mmekpa ahụ nakwa nnukwu ahụhụ ha tara n'aka ndị agha Naịjirịa n'oge agha Biafra. Ma ndị Igbo ma ọtụtụ ndị abụghị ndị Igbo socha katọọ etu Buhari siri debe ọnụ kwuo ya bụ okwu. Ọtụtụ ndị mmadụ wegara mkpesa nye Twitter maka ya bụ ihe, nke a so n'ihe mere Twitter ji wepụ ya bụ ozi. Lee ihe merenụ Na mgbede ụbọchị Tuzde ka Onyeisiala Muhammadu Buhari dọrọ aka na ntị gbasara ụlọọrụ ndị INEC a na-agba ọkụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. O kwuru nke a oge ọ nabatara onyeisioche INEC, ọkammụta Mahmood Yakubu, onye biara ịkọrọ ya maka etu e si awakpo ọtụtụ ụlọọrụ ha n'akụkụ Naịjirịa dị icheiche. Onyeisiala Buhari kwuru na gọọmenti enyela ndị omekome ahụ oge zuruoke. O kwukwara na ndị a na-emebisi ihe, anọghị ya oge a lụrụ agha Biafra, ha amaghịkwa ihe mere oge ahụ. Mana o kwere nkwa na ""anyị bụ ndị so lụọ agha ọnwa iri atọ ga-aza ha n'asụsụ ha ga-aka ghọta."" Onyeisiala Buhari kwuru na a gbanwela ndị isi agha nakwa ndị onyeisi ndị uweojii Naịjirịa, ""anyị ga-ahụ na ha nyere ezi nchekwa"". Ihe dị otu a o meela mbụ? Trump na Nnamdi Kanu bụ ndị ọzọ a ma ama amachiburu na soshal midia n'ihi okwu dị aṅaa. Cheta na ihe dị otu a mere n'oge mba Amerịka na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị, oge Twitter wepụrụ ụfọdụ ozi Onyeisiala Donald Trump tinyere n'akara Twitter ya. Donald Trump wepụrụ ọtụtụ ozi nke o ji ebo ebubo na ọ bụ nrụrụaka ka e ji chụtuo ya n'ọkwa onyeisiala, mana o nweghị ihe akaebe ọbụla o gosiri iji kwadoo okwu ya. Facebook sokwa na ndị wepụrụ ọtụtụ ozi Donald Trump tinyere n'oge ahụ. Mana oge Donald Trump malitere ịgbasa ozi site na Twitter na Facebook na-akpọ ndị nkwado ya ka ha gaa mee ngagharịiwe n'isi ụlọ omeiwu ha bụ 'Capitol building', Twitter na Facebook wepuru akara ya kpam kpam n'ọgbakọ ha. Chetakwa oge Facebook machiri Nnamdi Kanu, onyeisi ndị IPOB maka okwu ya nke ha sị na o nwere ike ibute ọgbaaghara. Facebook wepụrụ akara Nnamdi Kanu n'oge ahụ, mana o mechara mepee ọzọ jirikwa ya na-agbasa ozi. Iwu megidere mgbasa ozi na soshal midia Ihe nwereike ime ka a machie mmadụ na soshal midia Ọ bụ eziokwu na mmadụ ọbụla nwere ikike dịịrị ya ikwu ihe bụ uche ya oge niile, mana enwere ụdị nke ị ga-ekwu o, soshal midia nwere ike machie gị. Ihe nwere ibute mmachi na soshal midia gụnyere:" afirika-45617687,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45617687,Osun election: Ihe ndị mmadụ na-ekwu,"Dịka ọ kwụ ugbua, ndị Ọshụn amabeghị onye ga-abụ gọvanọ ha n'afo anọ na-abịa, mana echiche ha bụ na ọ ga-abịa na njedebe n'ụbọchị 27 nke ọnwa Septemba, 2018.","Adeleka na Oyetola bụ ndị nọ n'isi ọsọ a ugbua Ọ bụ oge ahụ ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec sị na a ga-emegharị ntuliaka n'atụmatụ Bekee kpọrọ ""Ward' atọ dị n'okpuru ọchịchị atọ na ya bụ steeti. Cheta na onye rụrụ ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ 'returning officer' na ntuliaka Ọshụn bụ Joseph Adeola Fuwape, kwuru na ntuliaka ahụ ezughi ezu makana ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ na ya bụ ntuliaka gosiri na ihe kewara pati abụọ nọ n'isi erụghị mmadụ ole nwereike ịtụ vootu na 'ward' ndị a akagburu ntuliaka ha. Ọ pụtara na ndị nwereike ịtụ vootu na 'ward' atọ a dị mmadụ 3498. Ihe onye zọrọ ọchịchị n'okpuru PDP jiri gaa onye nke APC na ntuliaka ahụ bụ mmadụ 353. Fuwape gbadoro ụkwụ n'iwu obodo mgbe o kwuru na a ga-emegharị ntuliaka n'ebe ndị akpọrọ aha dịka: N'ọdụ vootu nke 9, akara nke 001 nakwa 004 nke dị n'okpuru ọchịchị Orolu; ebe mmadụ 393 denyere aha n'akwụkwọ e ji ama ndị tozuru iso mee ntuliaka, a kagburu ntuliaka ebe ahụ makana ndị omekome buru akpati vootu gbalaga. Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara maka ntuliaka a Ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ na ya bụ okwu. N'ụbọchị Septemba 23, onye bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed, gwara BBC na ntuliaka a gosiri ndị otu ya na ha ekwesịghị iji PDP gwuo egwu n'Ọshụn. Ọ gakwara n'ihu kwuo na etu e si mee ntuliaka ahụ masịrị ha, agbanyeghi na onwere ebe ha che na Inec riri mperi. Mana, onye bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dere na soshal midia na echiche ya bụ na Inec emeghị nke ọma maka mkpebi ha mere banyere ntuliaka a. O kwukwara na ọdịghị n'aka Inec ịkabi ntuliaka ọbụla, na ọ bụ sọọsọ ụlọikpe nwere ike ime ihe a. Mana ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe a o kwuru, makana ha sị na ọbụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme, ma kwukwa na usoro ya dị n'iwu Naịjirịa. Ihe ọkaiwu gwara BBC Igbo Ike Chijioke bụ onye ọkaiwu kwuru na Inec nupuru isi n'iwu na mkpebi a makana ha ejighị akwụkwọ iwu Naịjirịa mee mkpebi a. Ha gụgidere vootu ruo etiti abalị O kwukwara na Inec jiri ntuziaka banyere ntuliaka nke Bekee kpọrọ ""electoral guidelines"" mee mkpebi a. N'ọnụ okwu ya: ""Ihe Inec kwesiri ime bụ ịchọpụta ihe iwu gbasara Naijirịa kwuru banyere ụdịrị ihe a mere n'Ọshụn. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51251698,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51251698,"Cancer, diabetes na ọrịa ndị ọzọ e jibu mara ndị okenye ndị ntorobịa na-arịazị ugbua","Ihe dịka afọ iri gara aga, e nwere ụfọdụ ọrịa a na-eche na ọ bụ sọsọ ndị okenye ka ụfọdụ ọrịa ndị a na-arịa.","Mana ugbua, ọrịa ndị a gụnyere ọrịa shuga na ọbara mgbali elu, so n'ọrịa na-egbu ndị ntoroọbịa ugbua. Ngalaba World Health Organization (WHO) bụ ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa, kwuru na ọrịa ndị a na-arịazị ndị ntoroọbịa ugbua, na-ebute ọnwụ mmadụ abụọ n'ime mmadụ atọ n'ụwa niile. Ọrịa ndị ahụ gụnyere: 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije' BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị dọkịta ajụjụ ọnụ maka ihe ngalaba ahụike WHO kwuru. Ihe ha kwuru bụ ihe mmadụ niile kwesịrị ige ntị nụrụ. Ihe ndị dọkịta kwuru: Onye na-ele shuga dị n'ọbara ya Otu n'ime ha bụ Dkt. Zubair Abdullahi bụ onye kwuru na ụfọdụ ọrịa ndị a na-adị n'agbụrụ, nke pụtara na ọ ga-emetụta ndị ahụ ma ha abụ okenye maọbụ ntoroọbịa. Onye nke ọzọ bụ Dkt. Henry Eze, kwuru na o nwereike ịbụ na ọgwụgwọ Bekee akawanyela mma, nke pụtara na a na-achọpụta ọrịa ndị a n'oge mgbe mmadụ ka bụ ntoroọbịa. Mana dọkịta abụọ a kwekọrịtara na oke ibu, iri nri ọjọọ nakwa emegharịghị ahụ, socha n'ihe na-eme ka ndị mmadụ bute ọrịa ndị a. Ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa n'ihi etu ha ha n'ibu Ha kwuru na ọ bụrụ na ị chọpụta otu n'ime ọrịa ndị a dị n'agbụrụ gị, ị gaghị agbanwenwu ya. ""Ọ bụghị ihe niile ka ị ga-agbanwenwu, mana ibi ndụ ọfụma ga-enyere gị aka dọtịa oge ọrịa ahụ ga-eji chukwute gị"". Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị: Onye meriri ọrịa kansa Akụkọ ndị a ga-amasị gị:" afirika-51981642,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51981642,World Water Day 2020: 'Anyị enweghi mmiri ọṅụṅụ n'obodo Ezeukwu-Alayi',Ndị obodo Ezeukwu-Alayi dị n'okpuruọchịchị Bende nke Abia Steeti etiela mkpu na ụdị ahụhụ ha na-ata ikute mmiri ọṅụṅụ mgbe ọkọchị.,"Otu nwaanyị a kpọrọ Nnenna Anyim gwara BBC Igbo na ahụhụ a bụ nke ọ malitere ịta n'oge ọ bụ nwata ka ọ ka na-ata ruo ugbu ọ lụrụla di. Ọ sị na ọ ewe ya awa abụọ iji ụkwụ a gaa ihe ruru kilomịta ise ikute mmiri ma lọghachị. Nnenna sị na ụkọ mmiri a na-akawanye njọ n'oge ọkọchị dịka iyi ndị dị ha nso na-atachasị kpamkpam. Na-agbanyeghi na mmiri ha na-enweta anaghị adị ọcha n'anya, ọ sị na onweghi ihe ọ na-eme ha n'ahụ ma ha ṅụọ ya maọbụ were ya sie nri. Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị obodo ha nwere ego agbalịala igwu 'borehole' mana mmiri na-apụta na ya na-atọ nnunnu. Ọ rịọrọ ka gọọmentị gbatara ndị obodo Ezeukwu-Alayi ọsọ enyemaka, iji mee ka ha nweta ezi mmiri ọṅụṅụ n'obodo ha. Ndị ihe onyonyo a: Ikechukwu Kalu na Chiemela Peter" afirika-45128217,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45128217,"Joe Blankson: Abalị itoolu elichara ya, ọ ka dị nwunye ya ka ọ bụ nrọ","Mercy, bụ nwunye Joe Blankson, nwoke nwụru ka ọ kpụpụtachara mmadụ iri na atọ dara na mmiri aka, si na ka abalị itoolu gara ka inichara ya, ya bu ihe ka dị ya ka nrọ.","Joe Blankson na nwunye ya mgbe nwa ya gbara afọ abụọ Blankson nwetara ezigbo otito maka akpamike ọ kpara iji zọpụta ndị mmadụ mgbe ụgbọmmịrị kpuuru n'ime mmiri ha n' Pọtakọt. Ọ bụ sọsọ Blankson nwụrụ na ya bụ mberede mere na ụbọchị Satọde, abalị 28 nke Jụlaị n'afọ 2018. Mercy, bụ nwunye dike a hapụrụ gwara BBC na ihe di ya mere atụghị ya n'anya maka ọ bụ onye na-enyere ndị mmadụ aka ọfụma. ""Di m nwere obi ebere, nwe obi enyemaka, ọ na-etinye ndị ọzọ n'uche ya. Ya bụrụ ma mmadụ tiri mkpụ n'ọnụ ụtụtụ, ọ bụ sọsọ di m ga-ekuli ga za oku ahụ mara ihe na-eme ebe ahụ."" O kwuru na di ya na-egbo ọgụ ọ hụrụ ma ọ na-anya ụgbọala ya n'ụzọ. Dike a dị afo 36, nụrụ Mercy n'afọ ise gara aga. Ha nwere ụmụaka atọ, mana nwa mbụ ha nwụrụ n'afọ 2016. Mercy sị na ama gbara ya na ajọọ ihe chọrọ ime Mercy sị na ihe ọjọ a mere ya, nke bụ na ya agaghị ahụ di ya ọzọ, bụ ihe ya ka na-achọ ịnabata, maka na ọ na-eche na di ya nwere ike bata imeụlọ mgbe ọbụla. Ọ sị na ụlọ ha dị chakoo ugbua. Mercy kwuru na otu oge nwa ya nwoke aha ya bụ Owen buru akpa ya sị na ya na aga Bakana ịga chọ nna ya. Etu akụkọ a sị rute ya ntị Na Satọde Jụlaị 28, Mercy sị na di ya gwara ya na ya ga-esi ọrụ ya ga akwamozi na Bakana. Mana, ka di ya akpọghị ya ka chi na-eji etu o si eme, ọ kpọ ekwentị ya mana ọ bụrụ na ọ gbanyụrụ agbanyụ. Mercy kpọrọ ndị ọyị di ya mana o nweghị onye gwara ya ihe ọbụla. Mgbe ahụ ka o bidoro chewe uche. Ka e mechera, nne di ya bịara gwa ya na di ya nọ n'ime ụgbọmmiri kpuuru. Ọ gwakara ya na a nacho ya achọ. Mercy sị n'uche ya bụ na a ga-ahụ ya na ndụ. Ọ gara be nne di ya ma hụ ka ndi mmadụ juru na-ebe akwa. Ha gwara ya na ha ahụbeghị ha. Ọ bụ ka chi foro ka nwunye di ya gwara ya na di ya anwụọla. Ọ bụ ndị na-akụ azụ hụrụ ozu di ya na-elu mmiri. E kweghị ya hụ ozu di ya maka omenaala ha sị na nwannyị na-enye nwa ara adịghị ahụ ozu di ya. Ọzọ bụ na ọ bụ na mmiri ka a na-eli onye nwụrụ na mmiri. Nke ga-eme ugbua Mercy nwere olileanya n' ọnwụ di ya ga-eme ka gọọmentị tinye anya ma mezie ọdọ ụgbọmmiri dị n'Abonnema nke ga-enwe ihe eji echekwa ndụ. O kwuru na ndị uweojii nke na-arụ na mmiri kwesiri ị na-enyocha ihe na-eme na mmiri, ma kwukwa na ngalaba na-ahụ maka mmiri kwesiri ịhụ na mmiri ahụ dị ọcha nke ga-eme ka ọ kwụsị ime ka ụgbọmmiri kpuo. Ka ihe dị ugbua, Mercy Blankson si na gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike, kwere nkwa inye aka maka ịzụ ụmụaka ya n'akwụkwọ ma nye ya ọrụ na gọọmentị. Ọ sị na ọ ga-adị mma ma ya bụrụ na Bakana hiwere ihe ebe ahụ di ya nọ nwụọ, nke ga-enye ya ebe ọ ga atụ aka ma ya bụrụ na ụmụ ya jụrụ ebe elili nna ya." afirika-44973633,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44973633,ICG: Ndị ọchịehi akpaala ike ugboro isii karịa Boko Haram,Ndekọ ọhụrụ apụtala ebe ndị otu na-ahụ maka ọgbaghara na mbaụwa a na-akpọ 'International Crisi Group (ICG)' na Bekee tiri mkpu na ndị ọchịehi egbuola mmadụ karịa ka Boko Haram gburula.,"Ndị mmadụ buru ngwongwo ha agbapụ n'obodo ha ka ndị ọchịehi gburu ihe ruru mmadụ 200 na Jos Nke a bụ agbanyeghi na Boko Haram bụ ndị a ma ama na mbaụwa dịka ndị na-eyi egwu, ha achịtaghị aja ebe ndị ọchịehi nọ maka na ndị ọchịehi egbuola karịa ha ugboro isii n'afọ a. N'akwụkwọ ahụ ha bipụtara na webusaịtị ha, ha kwuru na ndị ọchịehi egbuola mmadụ 1,300 kemgbe ọnwa Jenuwarị afọ a. Ha kọwara na kama ogbugbu ndị ọchịehi na-emebu na-akwadoghị akwado, ha na-ejizi anya ọcha kpaa nkata pụrụ iche etu ha si ekpochapụ obodo na ala ndị mmadụ. Akwụkwọ ahụ kwukwara na mbụ ọ na-abụ mkparị na-ebute mwakpo ndị ọchịehi na Benue, Platu, Adamawa, Nasarawa na Taraba steeti, mana ugbua, ọ bụzị nkata a kpara nke ọma imemina mmadụ. Nke a bụ ihe fọdụrụ n'ụlọ ndị mmadụ ndị ọchịehi mebiri na Jos Lee ihe buliri mkpamkpa ndị ọchịehi n'afọ a Agbanyeghị na o teela nsogbu ndị ọchịehi bidoro n'etiti ha na ndị ọrụugbo, nke aafọ a boliri uzu nke ukwuu. Lee ihe ndị ICG kwuru kpatara ya; Ebe ụlọ a dị otu a, ajụjụ ga-abụ ma o nwekwara onye si n'ime ya pụta maka na ndị ọchịehi na-eji abalị agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ Gịnị ka a ga-eme? Ọ bụghị naanị nsogbu ka akwụkwọ ahụ kwuru maka ya, ha tụtakwara aro etu a ga-esi mezie ihe ahụ ka ọ dị mma. Mkpamkpa ndị ọchịehi kparala na Benue, Platu na Taraba steeti kamgbe afọ 2018 ka jọ karịa na mgbe mbụ nke mere ọtụtụ mmadụ welitere isi na Naịjirịa ji akatọ onyeisiala Buhari maka na o meghi ihe siri ike iji kwụsịmaọbụ belata mwakpo ahụ. BBC Igbo gbalịrị inweta onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu ka o tinye ọṅụ nokwu mana ọ zaghị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-56932143,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56932143,Kidney diseases: Ihe ndị ị na-eme nwere ike iduba gị n'ọrịa akịrị,"Kemgbe ọ pụtara ihe na ọ bụ ọrịa akịrị gburu Mmesoma Obi, a ma dịka 'Ada Jesus' n'oge erughị eru, egwu ọrịa ahụ Bekee kpọrọ 'kidney disease' na-atụzi ọtụtụ ndị mmadụ.","Nke a bụ n'ihi na ọtụtụ na-ahụta ọrịa ahụ dịka 'ọnyịrịdịbịa'. Ọrịa akịrị amaghị nwata maọbụ okenye; O gburu Ada Jesus n'afọ 2021 ka ọ dị naanị afọ 23, onye ejije Muna Obiekwe n'afọ 2015 ka ọ dị afọ 36. End of Instagram post, 1 O gbukwara Musa Yar'Adua bụbu onyeisiala n'afọ 2010 ọ dị afọ 58. Otu WHO kwuru na otu nde mmadụ na ụma (1.2 million) nwụrụ n'ụwa n'afọ 2015 site n'ọrịa akịrị. Ọtụtụ amaghị ihe na-ebute ya, nke ha na-ama ihe ndị ha nwere ike ime iji gbalahụ ya,ebe ụfọdụ na-ebo ya akaọrụ ndị iro ha. Mana lee nkọwa Dọkịta Ifeoma Ulasi nke UNTH bụ ọkammụta akịrị Bekee kpọrọ 'nephrologist' nyere maka ya: Gịnị bụdị ọrịa akịrị? Ọrịa akịrị bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ na-ahụ maka iwepụ mammịrị na atịtị ndị ọzọ dị mmadụ n'ahụ. Dkta Ulasi kọwara ọrịa akịrị: ""Akịrị dị n'azụ ime afọ,ọ bụ akụkụ ahụ na-enyere anyị aka ka anyị nyụọ mammịrị. Ọ na-ewepụ ihe ọbụla anyị riri ahụ anyị achọghịzị site ịzacha ọbara."" ""O nwezie ka mmadụ si nwe ọrịa akịrị, ihe nile onye ahụ riri adọrọ onye ahụ n'ahụ, bido nyewe onye ahụ nsogbu."" Ihe ndị ọrịa akịrị abụghị Dkta Ulasi kwuru na ọrịa akịrị abụghị nsi maọbụ agha ndị iro maọbụ abụmọnụ mmadụ na-abụ ibe ya maka imejọ ya. Ọ rụtụrụ aka na e nwere ""Ndị na-akpọ onwe ha ndị amụma, na ha bụ ụkọchụkwu karịrị akarị"" ndị na-edufu ndị mmadụ rue oge ọrịa ha mebiri ọtụtụ ihe n'ahụ ha. "" Onye na-arị ọrịa akịrị ọ bụrụ naọ gaa ụlọgwụ n'oge, nwere olileanya iweta ngwọta. ""Onye nwe ọrịa, ya gaa ụlọọgwụ ma na-ekpekwa ekpere."" Ụdị ọrịa akịrị dị iche iche E nwere ụdị ọrịa akịrị dị iche iche; ndị nwere ike ngwọta na ndị na-ata akị n'ahụ onye ọ na-arịa : 1. 'Acute kidney disease/injury' ""...Mgbe ihe mere akịrị n'ike, akịrị ahụ mebie maọbụ merụọ ahụ."" ""E gbobido ya ma mee ihe e kwesịrị ime ,akịrị ga-adị mma."" Ima atụ: Ọrịa covid-19 nwere ike ibute 'acute kidney injury'. 2 'Chronic kidney disease' Nke a bụ oge ọrịa akịrị taarala mmadụ nchara n'ahụ. ""Mgbe ụfọdụ onye na-arịa ọrịa akịrị anaghị ama na ọrịa dị ya n'ahụ."" ""Ndị ụdị a na-arịakarị bụ ndị nwere ọrịa tara nchara dịka ọbara mgbalielu, ọrịa shuga, kansa na 'prostate'."" 3 'Nephrotic syndrome' Nke a bụ ọrịa akịrị na-eme ka protin karịa mamịrị onye ọ na-arịa. Dkta Ulasi sị, ""Nwatakiri nwe ụkwara, ọ nọkata ahụ ya azaba azaba."" O kwukwara na o nwere ike ime okenye. Njirimara ọrịa akịrị Ọrịa akịrị anaghị egosikarị onwe ya n'oge. njirimara ya na-eyikwa nke ọrịa ndị ọzọ. Ihe were anya e ji mara ọrịa akịrị bụ ihu aka na ụkwụ ịza aza. Mana e nwere njirimara ndị ọzọ gụnyere: - Mammịrị ịcha nnukwu edo edo - Ike ọgwụgwụ - Ịnyụ oke mamịrị - Ọbara dị na mamịrị maọbụ mamịrị gị ịdị oji lhe ndị nwere ike ibute ọrịa akịrị - Ịnụ ọgwụ Igbo -Oke ịṅụ ọgwụ ahụ mgbu -Aṅụghị mmiri ọfụma - Ọrịa shuga - Ọbara mgbalielu - Ọrịa Bekee kpọrọ 'glomerulonephritis"" -Nje na-ebute ọrịa mamịrị dịka e-coli Ụzọ ịgbalahụ ọrịa akịrị - Onye ọbụla kwesịrị ịṅụ lita mmịrị abụọ kwa ụbọchị. - Gbaara ịṅụ ọgwụ ahụmgbu maọbụ ịba aghara aghara ọsọ. Hụ dọkịta tụpụ ị ṅụọ ọgwụ ọbụla. Dkta Ifeoma Ulasi bụ dọkịta ọkachamara akịrị n'ụlọgwụ 'University of Nigeria Teaching Hospital' (UNTH) -Na-eme nnyocha ahụ oge ọbụla, e nyere ntuziaka ime ya. -I nwe ọbaramgbalielu na-aṅụchịte ọgwụ dọkịta nyere gị anya. -I nwe ọrịa shuga na-elekọta onwe dịka dọkịta si nye gị ntuziaka. -Na-eri ezigbo nri na-edozi ahụ. -Mmegharị ahụ Ihe igbochi ọrịa akịrị ji ka ọgwụgwọ mma Otu n'ihe igbochi ọrịa akịrị ji kaa mma karịa ọgwụgwọ ya bụ na ịgwọ ya abụghị ụtaba a chị n'aka agba egwu. Ya bụ ọrịa na-agba ego ọkụ. Dkta Ulasi sị na naanị ime 'dialysis' otu ugboro na-eri puku naira iri atọ na ise (N35000), nke onye ahụ ya chọọ ya ga na-enwe ugboro atọ n'izu ụkọ. E nwekwara ọgwụ ndị ọzọ onye ahụ ga na-aṅụ nke na-ada oke ọnụahịa. N'aka nke ọzọ ịgbanwe akịrị nke a na-akpọ 'kidney transplant' na Bekee na-erikwa nde kwuru nde. Onye e mere ya ga-ana agwụ ọgwụ ndụ ya niile iji hụ na ahụ ya ajụghị akịrị ọhụrụ e tinyere ya." egwuregwu-48156335,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48156335,Chelsea vs Watford: E gosila Watford na ọkwụrụ anaghị akarị onye kụrụ ya,Chelsea ekweghi ka Watford menye ha ihere ma napụ ha ọkwa nke atọ ka ha zutere taa.,"Ndị Chelsea chị ọkụ bịa ọkachasị n'ọkara nke abụọ oge e ji gbanye goolu atọ nyere ha mmeri. Goolu Ruben Loftus-Cheek nyere na nkeji 48, nke David Luiz nyere na nkeji 51 na nke Gonzalo Higuain nyere na nkeji 75, zuru imechi akwụkwọ. Mmeri a pụtara na Chelsea ga-enwe ohere ịzọ ma ha a ga-eso gbaa asọmpi Champions League nke afọ na-abịa. Watford hiri ụra, nke nyere Chelsea ohere iji otu pọintị wụfere Tottenham, ma jiri ise na-aga Arsenal ga-ezute Brighton na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Leicester City ụbọchị ụka na-abịa, ma ha na Eintracht Frankfurt gbachaa n'asọmpi Europa n'ụbọchị Tọzde, Mee 9." afirika-46375821,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46375821,Ipob: Lee foto onye uweojii nwụrụ n'ọgbaghara mere na Nnewi,"Dịka ndị na-agụ akụkọ BBC Igbo si rịọ, anyị gara nyocha ọzọ banyere mwakpo mere na Nnewi.","Ndị uweojii na-ekwu na ndị otu Ipob kugburu Inspector Akinbami ụbọchị ahụ ha mere ngagharịiwe na Nnewi Nke a mere ka ndị uweojii nọ n'Anambara steeti wepụta foto onye otu ha ahụ ha kwuru na ndị otu Ipob Kụgburu ụbọchị ha mere ngaghariwe na Nnewi BBC Igbo nwetara aha onye uweojii a sị nwụrụ dịka Inspector Akinbami Olaniyi na-arụ dịka CPS na Nnewi. BBC Igbo chọpụtakwara na ndị ahịa mechiri ahịa niile dị na Nnewi ruo ụbọchị abụọ. Ndị azụmahịa na Nnewi site n'ọnụ onyeisi ndị na-azụ ahịa na Nnewi bụ Muozom Edward, na-ekwusi ike na ha amaghị na ndị otu Ipob bịara ụbọchị ahụ. Ha na-ekwukwa na ebe ihe a mere dịchapụrụ n'ebe ndị otu Ipob nọ wee kpaa mkpamkpa a. Etu ụfọdụ ndị na-agụ akụkọ BBC Igbo si depụta mkpa ha n'akara Facebook Ihe MikeGodwithme kwuru MikeGodwithme kwukwara na ọ chọrọ foto na-egosi onye uweojii ahụ nwụrụ na ngagharịiwe Ipob mere na Nnewi. Ihe MikeGodwithme kwuru Cheta na gọvanọ Anambara bụ Willie Obiano gara Nnewi ịhụ ndị merụru ahụ n'ọgbaghara dara n'etiti ndị Ipob na ndị uweojii n'obodo ahụ, ọ rịọrọ ka ahụ na-atọghapụrụ ndị aka ha dị ọcha. Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ Nke a na-abịa ka ndi isi ahịa Nkwọ Nnewi gbachiri ya bụ ahịa. Ngalaba na-achikọta ahịa Nnewi gbachiri ahịa ahụ ụbọchị ole na oke gara aga, makana ndị otu ha asị na ndị uweojii nwụchiri n'ụbọchị Fraịde gara aga. Cheta na ndị uweojii nwuchiri mmadụ iri atọ na abụọ ha sị na aka ha dị na mwakpo na ogbugbu onye uweojii aha ya bụ Akinbami Olaniyi. Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ Agbanyeghi na ọtụtụ n'ime ndị a eji sị na ha bụ ndị ahịa, ndị uweojii sị na ha so memina ndị otu ha. Otu onye uweojii achọghị ka BBC kwuo aha ya sị; ""E gburu onye uweojii, ma gbaa ụgbọala anyị ọkụ, ndị a aka ji bn̄ụ ndị a hụrụ mgbe ndị uweojii ruru ebe ahụ."" Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ Ndị hụrụ mgbe ihe mere gwara BBC na ọ bu ndi na-ere ahịa n'ahịa ahụ ka aka ji. Lee ihe ha kwuru ebe a: ‘Mkpamkpa ndị uweojii mere e jiri gbaa ụgbọala ha ọkụ’ BBC gbara Kọmịsọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara Steeti bụ Don Adinuba ajụjụ ọnụ maka njem Obiano na Nnewi. Maazi Adinuba gwara BBC na Obiano gara Nnewi ileta ndị nọ n'ụlọọgwụ. Maka okwu Nkwọ Nnewi, Adinuba kwuru na Obiano na-agba mbo ịhụ na ahịa ahụ mepere ọsịsọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48747354,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48747354,AFCON Group D: South Africa aghọọla Erọn gbara aka laa,Mba Saut Afrịka enwetaghị onwe ha mgbe ha zutere Ivory Coast na asọmpi bọọlụ mba Afrịka 'AFCON 2019' taa.,"Jonathan Kodija nyere goolu Ivory Coast ji merie Saut Afrịka Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu asataghị asata wee gwa Saut Afrịka na nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ. Jonathan Kodija nyere goolu ahụ na nkeji 65 wee mewaa ndi Saut Afrịka obi. Nke a pụtara na Ivory Coast na Moroko nwere akara atọ akara atọ na ""Group D"" dịka Moroko ji otu ọkpụ goolu merie mba Namibia ụnyaahụ. Otu okwe si gbaa Saut Afrịka ga-agbazi mbọ imeri asọmpi nke ha na ndị Namibia ụbọchị Fraidee abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun 209. Na asọmpi nke ọzọ agbara taa, mba Angola na Tunishia nyere onwe ha otu goolu otu goolu ebe Mali na Mauritania ga-ezute onwe ha n'elekere itoolu nke abali. Akụkọ ga-amasị gị: Don Adinuba maka ndị ọchịehi Fulani." egwuregwu-49537080,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49537080,Southampton vs Man United: Akpịrị mmeri ka na-akpọ Man Utd nkụ,"Ọ fọrọ obere ihe ka ndị Manchester United gbara aka pọintị taa, dịka ndị Southampton na-ele ha ọbịa chasiri ha ọkụ ike.","Goolu Daniel James nyere na nkeji 10 e ji bido bọọlụ ezughi inye ha mmeri na-agụsi ha ike kemgbe Crystal Palace gwọrọ ha ara n'izu gara aga. Goolu a mere ya nke atọ James nyerela n'ime egwuregwu anọ ọ na-agbara Man Utd kemgbe ha zụtara ya. Jannik Vestergaard nke Southampton ji isi tawarie neetị David de Gea na nkeji 58, iji gosi Man Utd na ha akpọtaghị ha n'ụlọ ha ịgba ha nkiri. Goolu ahụ bụkwa nke mbụ Vestergaard na-enye kemgbe ọ gbawara n'Ịngland. N'agbanyeghi na e mechara chụpụ Kevin Danso nke Southampton na nkeji 73, Man Utd anyụghị anwụ nke ha ji agbọ ụja. Ka ọ dị ugbua, Man Utd enwetala pọintị ise n'ime 12, nke mere ka ha nọrọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League. Ebe Southampton nwere pọịntị anọ. Man Utd ga-ezute Leicester City bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Wilfred Ndidi na-agba, ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba." afirika-43962710,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962710,Ogbunigwe egbuola mmadụ 28 na Mubi,Ndị uweojii na Adamawa steeti na-ekwu na ogbunigwe gbara na Mubi gburu mmadụ 28 ma merukwa ndị ruru 50 ahu.,"Ogbunigwe so na ihe ndị Boko Haram jị ebuso Naịjirịa agha Ogbunigwe agbala na obodo Mubi bu obodo dị na Adamawa steeti nke ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Awụsa na Naịjirịa. Otu n'ime ogbunigwe a gbara n'ime ụlọ ekpere ndị alakụba. Ndi hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa na ọ ndị omekome abụọ kpara ike a. Otu gbara ogbunigwe ya n'ime be ndị alakụba na ekpe ekpere mgbe ha na-akwado ibido ekpere. Ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ nke izizi ahu, onye ọzọ gbapụkwara nke ya na ezi. N'ọnwa Nọvemba n'afọ gara aga ihe kariri mmadụ 50 mgbe Boko Haram gbara ogbunigwe n'ime ụlọ ekpere na Mubi. Ndị omeiwu ukwu si ka ndị gọọmentị mepe ọdọ ndị agha na Mubi. Onwebeghi ndi kwuru na ọ bụ ha kpara ike a, mana ndị Boko Haram bu ndi ama maka iji ogbunigwe gbuo ọtụtụ mmadụ na ọwụwa anyanwụ nke ugwu awụsa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49374976,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49374976,Port Harcourt Murder: Egwu ejidela ndị mmadụ maka nwaagbọghọ ọzọ a tọgburu,Egwu jizi ndị mmadụ na Pọtakọt n'ihi ozu nwaagbọghọ ọzọ e butere n'otu ụlọ oriri na nkwari n'mpaghara Woji nke dị na ogige G.R.A n'obodo ahụ.,"Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivas steeti bụ Nnamdi Omoni gwara BBC Igbo na ihe ahụ gbara ha gharịị mana ha ga-achọpụtarịrị onye kpara arụ ahụ. Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-ebute ozu nwaagbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Pọtakọt. Chetakwa na ụdị ihe a emekwaala na Owere, Sapele nakwa Legọs na nsonso a. Omoni kwuru sị: ""Anyi na-eleba anya ka anyị mata ihe kpatara ogbugbu ndịa nakwa onye maọbụ ndị aka ha dị na ya. ""Anyị agbaala ọtụ ndị ajụjụ ọnụ, ihe ha gwara anyị na-enyere anyị aka na nnyocha anyị na-eme."" O kwukwara na ndị uweojii na ndị nwere ụlọ oriri na nkwari ga-enwe nzukọ iji kpaa otu a ga-esi gbochie ihe dị otu a n'ọdịnihu. Elisabeth Ndubuisi Chukwu: ""Gọọmenti South Afirika gbachiri nkiti maka ọnwụ nwanne anyị"" ""Anyị ga amanye ndị niile nwere ụlọ oriri na nkwari ka ha tinye igwe onyonyo (CCTV) n'ụlọ oriri ha. ""Nke a ga-enyere ndị uweojii aka ịmata onye ọbụla batara n'ụlọ oriri ahụ."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ" afirika-47541671,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47541671,Election 2019: Gịnị bụdị inconclusive?,Otu n'ihe tụrụ ụmụ Naijria n'anya na ntuliaka gọvanọ afọ 2019 e mere na nso nso bụ na mpụtara ntuliaka e mere n'ebe ụfọdụ dị dịka Inec siri kwupụta 'inconclusive' na Bekee.,"Ụfọdụ steeti ndi Inec ekpebibeghị maka ntuliaka ha Steeti ndị a bụ Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti. Kemgbe nke a mere ya bụ okwu bụ 'inconclusive"" bụzị okwu ndị mmadụ ji ekwu okwu, ebe ụfọdụ amaghị ihe ọ pụtara. Gịnị bụ 'inconclusive? Onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Ọkaiwu Ifeanyi Ulumma kọwara na ntuliaka ịdị ""inconclusive"" pụtara ""ebe e mere ntuliaka a na-emerughị n'isi."" Kedụ mgbe a ga-asị na emerụghị ntuliaka n'isi? Olisa Agbakoba bụ nnukwu ọkaiwu a ma ama na Naijiria kwuru na onye meriri abụghị naanị na o nwere vote kachasị, ọ ga emeri na imirikiti mpaghara dị icheiche ebe e mere ntulika aka ahụ. Ụzọ abụọ ntuliaka nwere ike bụrụ ihe erughị n'isi dịka Agbakoba na Ulumma siri kwuo bụ: 1. Ọ bụrụ na ihe onye meriri ji ka onye o meriri ehighị nne, ọkachasị ma ọ bụrụ na vootu a kagburu dị nnukwu. 2. Ọ burụ na e nwere ọgbaghara, ebe ihe agaghị n'anya ya dịka ebe e nwere nsogbu izu igbe vootu N'ihe mere n' Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti, Ulumma na Agbakọba rụtụrụ aka na ' Ọ dị ka ebe ndị PDP na-emeri ka a kpọpụtara dịka ""inclonslusive."" Ulumma dụrụ Inec ọdụ si ha ha leruo anya ma nye onye ọbụla meriri mmeri ma ọ bụ onye APC, APGA maọbụ onye pati ọzọ, ha nye ya onye meriri."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44270427,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44270427,Buhari: Ka anyị lụọ ọgụ megide mwakpo ụmụaka,Onyeisiala Mohammadu Buhari wepụtara ozi iji cheta ụbọchị ụmụaka na Naịjirịa bụ nke o kwuru ka-akwụsị mwakpo ụmụaka.,"Naịjirịa na-echeta ụmụaka ha niile n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee N'ozi ya, Buhari kpọkuru ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ, ndị isi obodo, ndị isi okpukperechi, na ndị ọrụ bekee ka ha kee ajụ n'ume iji chekwa ugwu ruru ụmụaka. Ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbali sie ike chekwa ụmụaka site n'ihe mmerụahụ ọbụla dịka e dere ya n'iwu Naịjirịa. O kwuru na otu ihe kachasị mkpa nke ọchịchị kwere na nkwa bụ i nye ụmụaka agụmaakwụkwọ tara ọchịchị. O kwuru na ọchịchị ya agbaala mbọ ịhụ na-enyere ụmụakwụkwọ nrị kwa ụbụchị dịka ha kwere na nkwa. Ụmụakwụkwọ na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa n'obi ụtọ Buhari kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu Naịjirịa, na-atụmatụ si n'aka ha na-enye ya owuweanya na Naịjirịa nwere ndịnihu dị mma. N'ikpeazụ Buhari gwara ndị isi ụlọakwụkwọ dị icheiche ka ha gba mbọ chekwa ụmụakwụkwọ etinyere n'aka ha. N'otu aka ahụ,lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ncheta ụbọchị ụmụaka taa n'akara twitter: Onyeisi senate bụ Bukola Saraki kwuru na oge mmemme ncheta ụmụaka nke arọ 2018 kwesiri ị bụ mgbe onye ọbụla ga-eme ihe niile dimma iji chekwa ụmụaka. Ebe onye bụ bụ osote onyeisiala akpọrọ Atiku Abubakar ayọla ka onye ọbụla wepụta ohere ṅụọ ụmụaka Naịjirịa ma mee kwa ka ọchị hara ipụ ha n'ihụ." egwuregwu-43618442,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43618442,Joshua Vs Parker: Gịnị mere referii ji ewu?,"Na abalị Satọde, nwaafọ Naịjiria na-anọchite anya ndị Briten bụ Anthony Olufemi Joshua meriri Joseph Parker bụ onye New Zealand n'asọmpị itiọkpọ nke mba ụwa ha kụrụ.","Giuseppe Quartarone egbuola referii n'ọtụtụ asompi Mana onye na-ewu n'elu Facebook na Twitter bụ Giuseppe Quartarone bụ referii gburu asọmpi ahụ. Ọtụtụ ndị itiọkpọ na-amasị na-ewe iwe na Quartarone na-egbosa dike abụọ ahụ itiọkpọ oge obụla ọgụ siri ike n'oge asompi ahụ. N' okwu ha, nke a mere ka ọgụ ahụ ghara ịtọ ụtọ dịka o kwesiri. Otu onye kpọrọ onwe ya 'Wiggy' kwuru: ""E kiri m ọgụ ọzọ. Onye referii ahụ bụ ahịa ọghọm @EddieHearn A ghọgburu ndị itiọkpọ na-amasị. E mela itiọkpọ egwuregwu ndị mmadụ aghaghị emetụ ahụ?"" Quartarone bụ aka ochie n'ọrụ referii, onye gbuola n'ọtụtụ asompi kara aka mgbe gara aga. Otu n'ime ọgụ o gburu bụ ọgụ mere n'etiti Alexander Povetkin na Cedric Boswell ebe Povetkin nwetara nzere 'WBA, afọ asaa gara aga. Giuseppe Quartarone gburu n'ọgụ Scott Quigg, Martin Murray, Chris Eubank Jr na Kid Galahad. Cheta na Joshua nwere mmeri nyere ya ihe nrite WBO, nke mere ka o soro na ndị na-akụ ọkpọ nwere ihe nrite WBA, IBF nakwa WBO nke ndị agba heavyweight na mbaụwa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52113064,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52113064,Hope Uzodinma: Ihe mere o jiri chụọ 'Accountant General' n'ọrụ,Imo steeti enweela onye mgbakọ ego ọhụrụ aha ya bụ Obieze Chukwukama.,"Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma Chukwukama ga-anọchi anya Donald Igbo bụ onye gọvanọ Hope Uzodinma nyere ọsọ n'ụbọchị Tuzde. Ọnụ na-ekwuru Uzodinma bụ Oguwike Nwachuwku zipuru akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tuzde were kwuo na Chukwukama amalitela ọrụ na-egbughi oge. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Nwachukwu kwuru na ọ bụ ka ọrụ na-agawanye nke ọma ka gọvanọ ji họrọ onye mgbakọ ego ọhụrụ. Ọ kọwara na ""onweghi ihe ọbụla Donald Igbo mere, kama ọ bụ ka ọrụ gọọmentị na-aga n'ihu."" BBC Igbo kpọtụkwaara FCC Jones, bụ onye jibu ọkwa ọnụ na-ekwuru pati 'All Progressives Congress' nke Imo steeti. Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma Jones kwuru na ""ọ bụ ikike dịịrị gọvanọ ịhọrọ onye dị ya mma ka ya na ya rụkọọ ọrụ."" Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ọ bụ oge Rochas Okorocha bụ gọvanọ ka ọ họpụtara Donald Igbo dịka onye mgbakọ ego. Oge Emeka Ihedioha malitere ọchịchị, ọ hapụkwara Donald ka o jide otu ọkwa ahụ. Uzodinma hapụtụkwara ya n'ọkwa ahụ nwa obere oge tupu o mechaa nye ya ọsọ. Ndịagha achịgharịala ndị isi na-ebuso Boko Haram agha Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai Ọchịagha Naịjiriaịa aha ya bụ Faruk Yahaya abụrụla onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha bụ nke a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'. Ihe ruru ndị ọchịagha mmadụ 13 ka a chịgharịrị n'ụbọchị Tuzde. Ọnụ na'ekwuru ndịagha Naịjirịa kwuru na nchịgharị ahụ bụ iji mee ka ndị ọchịagha ahụ tinyekwuo uchu n'ọrụ ha. Ndị ya bụ nchịgharị metụkwara gunyere Olusegun Adeniyi onye bụbu onyeisi 'Operation Lafiya Dole'. Ugbua, Adeniyi agaala ụlọọrụ 'Nigerian Army Resource Centre' dịka onye nnyocha ukwu (senior research fellow). Ndị ọzọ bụ A.C. Agundu, H.I Bature, U.M Mohammed, na ndị ọzọ. Ha niile ga-amalite n'ọkwa ọhụrụ ha n'ụbọchị Wenezde, Abalị mbụ nke ọnwa Eprel afọ 2020." afirika-44299324,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44299324,Ngige ekwuola na agaghị ebuli ụgwọ opekata mpe na Septemba,Minista na-ahụ maka ọrụ na iwe ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na o cheghị na gọọmentị ka ga-ebulinwu ụgwọ ọnwa opekata mpe nke ndịọrụ a na-akpọ 'minimum wage' na Septemba.,"Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa Ngige kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ n'Abuja ụnyaahụ, kwuru na Septemba abụghị oge ha hibere iji bulie ụgwọ ọnwa opekatampe, kama na ọ bụ oge ha yiri izukọ wee kaa okwu ọnụ n'ihe gbasara ma a ga-ebuli maọbụ agaghị ebuli ya bụ ụgwọ. ""Kọmitee nke na-ahụ maka ịwepụta ụgwọ opekatampe ọhụrụ kwesịrị ịka okwu ọnụ na ngwụcha Septemba, ma gwa gọọmentị ihe ha kpebiri ka ha nwee ike tulee ya ma nabata ya tupu e ziga akwụkwọ ọrụ ya n'ụlọomeiwu ukwu."" Ngige kwuru na ikike ịkwụ ụgwọ a so n'ihe kacha mkpa ha ga-elebanye anya ka ha na-ekwu maka ụgwọọnwa opekatampe a. O kwuru na ọ bụ ịmata ihe ndị ọ gbasara gụnyere ndị ọchịchị obodo nakwa ndị ọrụ na-abụghị ọrụ gọọmentị chere, mere kọmitee ha ji bido ịgagharị gburugburu Naịjirịa. O kwukwara na ọ bụ ka ha na-eme ngagharị a ka ha ji hụ na ụfọdụ ndị ọchịchị obodo tinyere akwụkwọ ka e bido ịkwụ ego sitere na puku naịra iri abụọ na abụọ (N22,000) ruo puku naịra iri ise na asatọ (N58,000), ebe ụfọdụ kwuru ka ha ka na-akwụ puku naịra iri na asatọ (N18,000) maka na ọ ka na-ara ụfọdụ steeti ahụ ịkwụnwu nke dị adị. Ngige kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ kwenyere na etu ụgwọ opekatampe a ga-esi dị ire bụ na a ga-atulegharị etu e si ekesa ego a na-enweta ugbua ka o nwee ike bara ndị steeti nakwa ndị ime obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 43043486,https://www.bbc.com/igbo/43043486,Boko Haram: Gọọmentị atụnyela mmadụ 20 na mkpọrọ,Ihe rụrụ mmadụ 20 bu ndị otu oyi ndụ egwu Boko Haram ga-aga mkpọrọ n'ime ọtụtụ ndị ekpere ikpe.,"Ndị agha Naịjirịa no na-ebụso Boko Haram agha na ugwu mmalite anyanwu Naịjirịa A mara ndị a ikpe n'ụlọịkpe ndị agha dịna Kainji nke Naịja Steetị bụ ebe a nọ kpe ikpe a. Otu onye ngwọrọ ọrụ ya bụ inye aka tọrọ ụmụaka Chibok 200 na 2014 so n'ime ndị ga-aga ụlọ mkpọrọ afọ 15. Ụmụ Chibok ndị atughapụrụ Nke a bụ mbụ a na-ama onye aka sọ na ntọro ụmuakwụkwọ Chibok ikpe. Ụlọikpe a tọhapụrụ mmadụ abụọ n'ime ndị a maka enweghi ihe a ga-eji ma ha ikpe. Gọọmentị Naịjirịa si na ha ji ihe karịrị mmadụ puku 6 bu ndị eche na ha bu ndị Boko Haram na ebe di icheiche na Naijirịa. Na Ọktoba 2017, ha tụrụ mmadụ 45 mkpọrọ afọ 31." afirika-47019228,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47019228,Aisha Buhari: Akatọghị m mwepụ Onnoghen,"Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari achọghị iji isi ekote okwu ""na-agbasaghị ya"".","Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya Aisha kwuru sị na akụkọ na-agagharị na ọ katọrọ mwepụ Onyeisi ọkaịkpe Naịjirịa bụ Walter Onnoghen, bụ ezigbote asị n'ihi na o tinyeghi ọnụ na ya bụ okwu. O kwuru nke a site n'ọnụ onye mgbasa ozi ya bụ Suleiman Haruna, nke ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmad depụtara na Twitter. End of Twitter post, 1 Mahadum adịgboroja: Gọọmentị enyela iwu sị ka ngalaba na-ahụ maka mahadum na Naịjirịa bụ NUC tinye anya n'igbochi mahadum adịgboroja ruru iri isii na ndị ọzọ dị ka ya. Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Malam Adamu Adamu, gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja, ebe o kwuru na etu mahadum ndị a si ewelite isi abụrụla ihe ihere nye gọọmentị. Na mba ofesi, Ihe nwụrụ ka ogbunigwe abụọ gbapụrụ n'ụlọụka dị n'obodo Jolo na mba Philippines eruola mmadụ iri abụọ. Nke a abụghị mbụ a na-atụ ogbunigwe n'ụlọụka a Ihe merụkwara ahụ n'ọdachi a akarịala iri na abụọ na ụma, mana enwebeghi otu ndị kwetara na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a. Gbasara egwuregwu: Dị ka a na-akọ, ndị ntọ mmadụ emeela ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị ịwa na Zamfara steeti. Akụkọ si ebe ahụ eru anyị ntị na-akọwa na ndị ntọ karịrị iri abụọ wụchiri otu ebe ndị mmadụ na-agbakọ ele bọọlụ n'obodo Birnin Magaji, wee tọrọ mmadụ asaa. N'egwuregwu tenis, Novak Djokovic amaburula iko Australian Open site na imeri Rafael Nadal bụkwa dachịị n'egwuregwu a. Djokovic ebuliela iko Australian Open ugboro asaa N'etiti Ohaneze Ndigbo na Rochas. Okorocha kwuru na ọ bụghị mbụ Ohaneze ndị Igbo na-akwado Pati PDP na ntuliaka Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na nkwụnyere Ohaneze ndị Igbo kwụnyere Atiku Abubakar na Peter Obi (ndị na-azọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP) enweghị isi. Rochas onye si n'ọnụ Sam Onwuemeodo bu onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ọha kwupute nke a, kwuru na Ohaneze Ndigbo abụghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị, nke nwere akpati ebe a ga-atụnyeli vootu maobụ ebe a ga-eje tụnyere ha vootu , ya mere okwu ha echukwaala ụmụ Igbo ụra. Okorocha kwuru na ọ bụghị taa ka Ohaneze ndị Igbo na-akwado Pati PDP maka oche onyeisiala, na-ekwukwa na mgbe ha mere ya na ntuliaka afọ 2015, pati ahụ dara. O kwuru na ugbua, ""Ohaneze Ndigbo kwesiri ihi aka isaa n'anya n'imata pati ha ga-akwado na ntuliliaka na-abịanụ."" Ọzọ, Garba Shehu Anyị agaghị ekwe ka ndị mba ofesi tuziere anyị ihe anyị ga-eme n'obodo anyị. Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu kwuru nke a. Ọ dọrọ aka na nti a n'Abuja iji saghachi ndị mba UK,Amerika nakwa European union gbasara nkwụsị ọrụ okaipe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ụbọchị Fraide,nke Janụarị iri abụọ na abụọ. Cheta na ka onyeisiala Muhammadu Buhari wepụchara Onnoghen na o tinyere Ọkaipe Muhammadu Tanko ozigbo nke mere ka ọtụtụ mmadụ katọọ ya bụ atụmaatụ. N'ofesi, Trudeau tinyere John McCallum dịka onye nnochiteanya Canada na China n'afọ 2017 Aka na-achị mba Canada bụ Justin Trudeau achụọla onye na-anọchite anya ndị Canada na mba China bụ John McCallum. Atụmaatụ a na-eme maka okwu ọjọ McCallum kwuru gbasara ikpe onye gbalitere n'ọkwa n'ụlọọrụ na-eme ihe gbasara ekwenti akpọrọ Huawei. N'egwuregwu, Novak Djokovic na Rafael Nadal ga-akwata ya taa dịka ha ga-apia bọọlụ agba nke ikpeazụ Australian open nke afọ a. Djokovic na-achọ ka o rite nturugo ụmụ nwoke na ya bụ asọmpị nke ugboro asaa ebe Nadal nwereike ịbụ nwoke mbụ ga-erite nturuugo grandslam nke ugboro abụọ. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa 'Ohaneze na-etinye Ndigbo n'ọnya dịka n'afọ 2015'" afirika-54589157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54589157,Judicial Panel of Inquiry: Steeti Ọwụwa Anyanwụ edepụtala aha ndị ga-enyocha SARS,Ụfọdụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekpokọbala otu ga-amalite inyocha ma kpee ndị uweojii SARS a na-ebo ebubo oke ogbugbu na mmekpa ahụ ụmụ Naịjiria.,"Gọvanọ Abia steeti họpụtara ndị ga-anọ n'otu a ga-elebanye anya n'ihe gbasara mmegbu ndị uweojii na-eme ndị mmadụ na steeti ahụ. Ndị Gọọmenti Abia hụpụtara Ndị Gọvanọ Abịa steeti họpụtara gụnyere: Ọkaikpe S N Imo (larala ezumiike nka) - Onyeisi ngalaba a Nwakanma John Daniel Chinagozi Ariwa Zuby Eric Ikwuagwu na-arụ na ministrị ikpenkwụmọtọ Bishọpụ Sunday Onuoha John Emejor Nnanna Nwafor Mrs Doris Ogala Ha ga-amalite n'elekere mbụ nke ehihie Fraịde bụ 23 nke ọnwa Ọktoba a. Chibuike Amaechi: 'Ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịwe End SARS na-enweri anụrị' Ndị Gọọmenti Anambara steeti Họpụtara Gọọmenti Anambara egbughị oge n'ihibe nke ha. Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba depụtara aha ndị so n'otu 'judicial Panel of inquiry' dịka: Adinuba gakwara n'ihu depụta aha onyeisi ngalaba ahụ dịka Justice Umeh laalara ezumike nka. Ndị ọzọ gụnyere: 1. Onye nnọchiteanya ụmụakwụkwọ niile nọ 2.Ndị isi ntoroọbịa atọ si mpaghara atọ n'Anambara 3. Otu onye na-efe ala nna ya na steeti ahụ 4. Onyeisioche otu 'Civil Liberties Organisation' nke steeti ahụ 5. Onyeisioche 'Youth Council of Nigeria', ngalaba dị na Anambara steeti 6. Onye nnọchiteanya ngalaba ndi ntoroọbịa Ohaneze ndịIgbo nke dị na Anambra steeti. 7. Onyeisioche ngalaba jịkọtara otu nke Kraist na Anmbra steeti 8. Onye nnọchiteanya Archibishop ụka Anglikan, nke Niger 9. Onye nnọchiteanya Archbishop ụka Catholic, nke diocese Onistha 10. Onye nnọchiteanya Pentecostal Fellowship of Nigeria, nke Anambra steeti 11. Onye nnọchiteanya onyeisioche otu jịkọtara Anambra State Traditional Rulers Council. 12. Onye ọkaikpe ukwu nakwa kọmishọna na-ahụ maka ikpe kwụ ọtọ. 13. Kọmịshọna na-ahụ maka ndị ntoroọbịa nakwa ọnatarachị 14. Ndị kachasị bụrụ ntoroọbịa n'etiti State Executive Council 15. Onye ndụmọdụ gọvanọ Anambra steeti n'ihe gbasara nchekwa zuru oke Ndị ọzọ ga-esonye gụnyere 1. Comrade Chijioke Ifediora2. Comrade Chukwuma Okpalaezeukwu3. Comrade Miriam Tochukwu Godspower4. Comrade Henry Chibuike Ugwu, Akụkọ ka na-abịa dịka anyị ga-ewetara ụnụ aha ndị so na ọgbakọ ""Judical Panel of inquiry"" na steeti ndị ọzọ. Apprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43639068,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43639068,Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ha na-enyocha ma mmadụ 30 enwere ịba Lasa n'Ụmụahia,Akụkọ ndị kachasị mkpa n'utụtụ a Ụlọọgwụ FMC na-enyocha ma mmadụ ịrị atọ enwere iba Lasa,"Ụlọọgwụ Federal Medical Centre n'Umuahia ekwuola na ha na-enyocha ma mmadụ 30 enwere ịba Lasa. Ha kwuru na ha nwere nkpebi a maka dokinta Chizorom Ndukwu bụbụ onye na-arụ ọrụ na ụlọọgwụ FMC ịba lassa gburu. Ha kwuru na ugbua, ndị okachamara na ihe gbasara ọrịa a abiaala Ụmụahia maka ịhụ na ọrịa agbasaghị. Egbuola ndị uwe ojii abụọ na Kogi Ndị oji egbe egbuola ndị uweojii abụọ ma merụọ otu nwoke ahụ na n'ụlọorụ ha na Gegu n'ime Kogi steeti. Onye na ahụ maka mgbasa ozị gbasara ndị uweojii na steeti ahụ bụ Williams Ayah kwuru na ha zuru ọtụtụ egbe na mgbọ. O kwukwara na ọchịchị gbara maka latrik adighi nke nyere ha ohere ikpa ika a akpalu. Otu nwaanyị egbuola onwe ya ma merụọ mmadụ atọ ahu na Califonia Otu nwanyị agbaala egbe wee merụọ mmadụ atọ ahụ tupu o gbuo onwe ya n'ụlọọrụ ihe onyonyo nke akpọrọ Youtube n'obodo California. Ndị uweojii sị na enyi nwoke nwaanyị a so na ndị merụrụ ahụ. N'egwuregwu Real Madrid emeriri Juventus n'asọmpị Champions League agbaara ụnyahụ. Ha nyere ha ọkpụ atọ na asaghị otu. Mana goolu ""Bicycle kick"" goolu Ronaldo nyere bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na eti mkpu n'elu igwe okwu social media Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" 42791509,https://www.bbc.com/igbo/42791509,Ndị uwe ojii ahapụla onye kpokobara otu #BringBackOurGirls,"Ndị uwe ojii n'Abuja ahapụla onye kpokobara otu #BringBackOurGirls bụ Oby Ezekwesili, onye ha jidere ya na ndị otu ya na Unity Fountain dị n""Abuja.","Ezekwesili bidoro otu #BBOG iji gbapụta ụmụaka Chibok Dịka Ezekwesili siri dee n'akara twitter ya, o kwuru na ndị uwe ojii agwaghị ha ihe ha mere ha jiri kpụrụ ha. O kwuru na ha gwara ndị uwe ojii ahụ ka ha gwa ha ihe ha mere megidere iwu mana onye isi ndị uwe ojii n'Abuja bụ CP Bello sịrị ha gawa. Ezekwesili kwukwara na kọmishọna ahụ kwuru ka a hapụ ya na ndị otu ya ka ha laa. End of Twitter post, 1 Ezekwesili tiri mkpu oge a nwụchiri ya ndị otu ya na Unity Fountain na-ekweghi ka ha hapụ ebe ahụ. O depụtara n'akara ya na twitter na ndị uwe ojii ahụ jidere ya na ndị otu ya dịka ha na-eme njegharị iwe gbasara ụmụaka ụmụnwaanyị Chibok ndị Boko Haram tọrọ n'afọ 2013. Ezekwesili ji otu #BringBackOurGirls na-amanye gọọmenti ka ha gbapụta ụmụaka Chibok ndị a na-agbapụtabeghi. Otu ahụ mekwara mba ụwa niile jiri kwado ala Naịjirịa oge ndị Boko Haram tọrọ ụmụaka ahụ. Otu onye ndu n'otu ahụ, gwara BBC na ọ tụrụ ha n'anya ihe ha mere megidere iwu e jiri kpụrụ ha. Ha kwuru na ihe ndị uwe ojii mere megidere ọchịchị onye kwuo uche ya. O dobeghi anya mmadụ ole ndị uwe ojii nwuchiri na ihe kpatara ha ji kpụrụ ha. Oby na ụmụnwaanyị ndị atọrọ ụmụ ha Chibok Ezekwesili buburu mịnịsịta na-ahụ maka agụmakwụkwọ. Mbọ niile BBC Igbo gbara iji nweta ndị uwe ojii amịtaghị mkpụrụ dịka ndị uwe ojii anaghị aza oku. N'aka nke ọzọ, Ezekwesili bidoro otu ọzọ ọhụrụ nke ọ kpọrọ otu Red Card. O kwuru na otu a bụ iji mee ka Naịjirịa nwe ezigbo ọchịchị na ịchụpụ ndị anaghị achị nke ọma." afirika-49632006,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49632006,"Abia Poly sack: ""Gọọmenti chọrọ ikpuchi nchọpụta ndị omeiwu mere"" - Cmdr. Nwachukwu Chukwu",Comrade Nwachukwu Chukwu bụ onyeisioche ndị otu Senior Staff Association nke Politekinik Abia steeti ekwuola na obi adighị ndị ọrụ mma maka ọchụchụ mberede gọọmenti chụrụ ndị ọrụ ha.,"Chukwu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC sị na gọọmenti chọrọ ịchụ ndị ọrụ eji ụgwọ ọnwa iri na isii. Ọ sị na ha nọ na ụbọchị Wenezde mgbe ndị uweojii dị iri na atọ (13) bucha egbe batara ụlọakwụkwọ iyi ndị mmadụ egwụ. Mgbe ha gara ịjụ ndị isiụlọakwụkwọ ihe mere ndị uweojii jiri kpojuo ụlọakwụkwọ ha, ndị isi gwara ha na onwere ndị achọrọ ichụ n'ọrụ. Chukwu kwuru na onwere ihe gọọmenti na-ekpuchi nke mere ha ji bia ịwakpo ụlọakwụkwọ ahụ tupu nchọpụta ndị ụlọomeiwu mere apụta. Ọ sị na ndị ụlọomeiwu nọ ọrụ nchọpụta n'Abia Poly kemgbe ọnwa Julaị afọ a mana gọọmenti echeghị ka nchọpụta ha pụta ihe. N'uche ya, kọmitii ndị omeiwu chọpụtara ọtụtụ ihe mkpughe nke gọọmenti achọghị ka ọ pụta ihe. Ugbua, ndị ọrụ niile n'Abia Poly gbara ọsọ ndụ ka ndị uweojii ghara ịmeru ha ahụ, dịka Nwachukwu si kwuo. Ọ sị na 'ndị isi otu anyị nọ n'ọsọ ndụ maka egwụ a na-eyi ha"". Ọ sịkwa na ha na-agagharị ịkpesara ndị otu ha dị icheiche dịka ndị ""Nigeria Labou Congress"" ka ha gbatara ha ọsọ enwemaka ma gbaziere ha ụzọ otu ha ga-esi mee ka gọọmenti gee ha nti. Comrade Nwachukwu Chukwubụ onyeisi otu ndị ọrụ Abia Poly Chukwu kwuru na ọnweghị ihe dị njọ ịchụ ndị ọrụ mgbe gọọmenti chọpụtara na ha agaghị akwuli ha ụgwọ, kama na ekwesiri ịkpa ya akpa. Ọ sị na ọbụghị maka asambodo adigboroja ka e ji chụọ ndị ahụ n'ọrụ maka na oteelarị achụchara ndị ji asambodo adịgboroja nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị e mechara kpọhachite azụ. Mana onyeisi ọrụ nta akụkọ gọvanọ Abịa steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na ya bụ oke mmiri ruwere kemgbe 2015. Ememenka kwuru na ndị na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọakwụkwọ kariri ego ha na-arụta. Dịka o si kwuo, ""naanị ndị nche na-arụ n'ụlọakwụkwọ karịrị iri asatọ (80)"". Ọzọ bụ na ọtụtụ mmadụ na arụ ebe ahụ ji asambodo na-abụghị ndị ọma ya. Ya kpatara gọọmenti ji hibe kọmitii lebere anya na ọrịa ji ya bụ ụlọakwụkwọ nke mere na ha enweghị ike ikwuli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha. Onyebuchi Ememanka - Onyeisi ọrụ nta akụkọ gọvanọ Abia steeti Agbanyeghị ego mmachi akpa gọọmenti na-enye ha, ụlọakwụkwọ ji ụgwọ toruru ijere naịra abụọ bụ nke Ememanka gwuru na gọọmenti steeti ahụ kwuchapụrụ na 2015. Ya kpatara ya bụ kọmiti ji sị ka a chụọ ndị a niile iji mee ka ya bụ ụlọakwụkwọ kurutu ume ndụ ma kowekwa akpa ya ebe aka ya ruru. Nke a butere ịchụ mmadụ ruru nari abụọ na ụma iri ise na asatọ n'ọrụ. Ememanke kwuru na gọọmenti kwere nkwa ịkwụchapụ ha ụgwọ e ji ha agbanyeghị na-ekwesiri ịtụ ha mkpọro maka asamodo adigboroja ha ji bata. Akụkọ ga-amsị gị Robert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ" afirika-45009558,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45009558,A kwụsịla ndị omeiwu APC na Benue ọrụ n'ike,Ndị omeiwu nọ n'otu pati PDP na Benue steeti akwụsịla ndị otu ha mmadụ asaa nọ APC ọrụ n'ike.,"End of Twitter post, 1 Ndị omeiwu PDP ahụ ruru mmadụ iri na itoolu na-akwụsị ndị otu ha ọrụ maka ime omume megide ụlọikpe na ime ọgbakọ megidere iwu. Ndị PDP ahụ kwuru na ọgbakọ ndị APC mere megidere iwu maka na ha erubeghi isi nye mkpebi ụlọikpe nyere ka ha ghara ịga onye bụbụ onyeisi ha bụ Terkimbi Ikyange nso. Ndị omeiwu PDP ahụ kpọkwara ndị otu mbaụwa ka gbata ọsọ enyemaka na nsogbu dị n'ụlọomeiwu Benue steeti ugbua. Ndị omeiwu APC mere ọgbakọ taa ebe ha tiri iwu ka a chụtuo gọvanọ steeti ahụ bụ Samuel Ortom maka ebubo na o mefuru ego steeti n'ụzọ na-ekwesighi ekwesi. N'ụtụtụ taa, ndị uweojii wakporo ụlọomewiu steeti ahụ na-ekweghi ka ndị omeiwu PDP mmadụ 22 banye. Mana ndị otu pati PDP anabataghị nke a nke ọma ebe ha nọ n'akara ha na twitter na-eti mkpu maka ya bụ ihe ha kpọrọ mmerụaka. Cheta na ụlọikpe nyere iwu n'izu gara aga ịkwụsị onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Terkimbi Ikyange ka ọ ghara ịkpọzi onwe ya onyeisi ha. Iwu ahụ metụtakwara osote onyeisi ahụ bụ James Okefe Ejembi na onye bụbu onye ndu ndị ka n'ọnụọgụgụ bụ Benjamin Tilley Adanyi. Ọkaikpe steeti ahụ bụ Adam Onum kwuru ka ikpe ahụ digide rue oge a ga-ekpebi ikpe ndị ụlọomeiwu ahụ mmadụ asatọ gbara n'ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-45163528,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45163528,Liverpool nyụrụ West Ham anya ka Manchester City gosiri Arsenal nkarị,Arsenal ji mmeri e meriri ha bido afọ ọhụrụ Premier League ka Manchester ji 2-0 merie ha na be ha.,"Mohamed Salah nyerela Liverpool goolu 44 n'afọ 2017/2018 Raheem Sterling bu ụzọ nyere Manchester City goolu ka ọ gbanyere goolu na nkeji 14, tupu Bernado Silva e mezuo ya abụọ na nkeji 64. N'ime egwuregwu nke mbụ a gbara, Liverpool gwọrọ West Ham ka abacha ka ha ji 4-0 merie ha. Mohamed Salah bu ụzọ nye goolu na nkeji 19 tupu Sadio Mane agbanye goolu abụọ na nkeji 45+2 nakwa nkeji 53. Daniel Sturridge mezuru ya anọ na nkeji 88. Lee ihe a gbatara na bọọlụ niile a gbara na Premier League n'izu a. Southampton 0 - 0 Burnley Huddersfield Town 0 - 3 Chelsea Man Utd 2 - 1 Leicester City Newcastle United 1 - 2 Tottenham Hotspur AFC Bournemouth 2 - 0 Cardiff City 'Fulham 0 - 2 Crystal Palace Watford 2 - 0 Brighton & Hove Albion Wolverhampton Wanderers 2 - 2 Everton" 43946040,https://www.bbc.com/igbo/43946040,Steeti 17 enweghị ego n'akpa,"Nchọpụta nke Economic Confidential mere gosịrị na ihe ruru ọkara steeti dị na Naijiria enweghị ego n'akpa ha a ga-akpọ ego ha nwetara onwe ha , ebe ọ bụ sọọ ego sị n'akpa gọọmentị etiti eku ume.","Steeti 17 bụ udu gbara chakoo Economic Confidential bụ ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ wepụtara ngụkọ ka steeti siri kwụrụ na mkpata ego onwe ha nke a kpọrọ Annual States Viability Index (ASVI) na bekee nke gọsịrị na steeti iri na asaa bụ ụkwa mkpụrụ adịghị n'ihi na ego ha nwetara onwe ha erughị pesentị iri ihe ha na-eketa n'akpa gọọmentị etiti. Ngụkọ nke Economic Confidential mere gosịrị na ewepụ ego ha na-anata n'aka gọọmenti etiti kwa ọnwa nke sitere n'ire mmanụ agbịdị, steeti ndị a agaghị na-eku ume ma ya fọdụ ịdị ndụ. Ego steeti na-enwetara onwe ha nke a kpọrọ IGR n'aha ịchafụ na-esite na ụgwọ-isi ndị ọrụ, ụtụ okporoụzọ na kwa ego ndị mịnịstrị na ngalaba gọọmentị na-anata. N'afọ 2017, Legos bụ steeti kachasị nweta ego onwe dịka o nwetara ijeri naịra 333 (N333Bn) nke ka ego steeti iri atọ (30) ndị ego ha pekarịchara na-enweta ma achịkọta ego ha ọnụ. E wepụ Legos, steeti ndị ọzọ ego ha na-enwetara onwe ha karịrị pesenti iri atọ ihe ha na-enweta n'akpa gọọmenti etiti gụnyere Ogun, Rivas, Edo, Kwara, Enugwu na Kano steeti ndị gbakọtara nweta ijeri naira 607,(N607 Bn) ebe steeti ndị ọzọ gbakọtara nweta ijeri naira 327(N327Bn). Ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ ahụ depụtakwara ego niile steeti ọbụla natara n'akpa gọọmenti site Janụwarị rue Disemba, afọ 2017. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43986134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43986134,Gbasaanụ ozi kwụọtọ -Buhari,Tata bụ ụbọchị eji echeta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile.,"Buhari na-ebokarị ndị ọrụ mgbasa ozi Naịjirịa ebubo ozi ụgha Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari jikwa ohere a ekwe ndị ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nkwa na ọ gaghị na-esonye aka na otu ha sị arụ ọrụ ha. Buhari yọkwara ha ka ha na-agbasa ozi ziri ezi. Isiokwu ncheta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile nke arọ 2018 bụ ""I lebanye anya na mmefusi ikike,ikpe kwuọtọ nakwa nhatanha iwu. Ọtụtụ ndị ọrụ mgbasa ozi etufuola ndụ ha ebe ha na-arụ ọrụ ha O si n'ọnụ onye na-enye ya ndụmọdụ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina wee na-atụghari uche na isiokwu a. Buhari kwuru na-ekwesi mkwa ike na ya ga-ahụ na anaghị emegide ndi ọrụ mgbasa ọzi na Naịjirịa ma ha na-arụ ọrụ ha. N'ọnụ ya ndị ọrụ mgbasa ozi mara amara na anyị ga-edowe okwu anyị,mana anyị chọrọ ka ha gbasa ozi kwụọtọ,gbara ndị mgbasa ozi na-achọ ị bute ọgbaghara n'obodo ọsọ. Onyeisiala sị na o kwetekwara na ndị mgbasa ozi ziri ezi na-ebute ọganiru n'obodo mana ọ ga-adimma ka ndị ji ya bụ ọrụ ebute ọgbaghara chegharịa. Ọ dọkwara aka ntị gbasara ntụliaka na-abia na 2019,na-ayọ ka ndị mgbasa ozi gbasa ya n'ụzọ kwụọtọ n'agbanyeghị onye ọbụla so na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55242240,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55242240,"Google top search Nigeria 2020: Ofe egusi, ofe ọha na ihe ndị ọzọ ndị Naịjirịa kachasị chọọ na google",Ụlọọrụ igwe e ji achọ ihe n'ịtaneti wepụtara ụfọdụ ihe na aha ndị Naịjirịa kachasị chọọ n'ịtaneti n'afọ 2020.,"A na-eji anụ maọbụ azụ esi ofe egusi Ihe ndị akachasị chọọ gụnyere aha mmadụ, egwu, nri, ajụjụ ndị akachasị jụọ dgz. A bịa na nri ofe egwusi, ofe ọha, achịcha (bread) so na ndị akachasị chọọ. Nri iri akachasị chọọ (Naịjirịa) 1.Pornstar martini recipe 2.Puff puff recipe 3.Pancake recipe 4.Red velvet cake recipe 5.Meat pie recipe 6.Chin chin recipe 7.Bread recipe 8.Chocolate cake recipe 9.Oha soup recipe 10.Egusi soup recipe Ndị a bụ ndị mmadụ akachasị chọọ n'igwe 'google search' n'afọ 2020. Mmadụ iri akachasị chọọ (Naịjirịa) 1.Joe Biden 2.Rema 3.Naira Marley 4.Rahama Sadau 5.Hushpuppi 6.Laycon 7.Kamala Harris 8.Omah Lay 9.Maryam Sanda 10.Kai Havertz Lee aha egwu iri akachasị chọọ n'ịntanetị n'afọ 2020 Egwu iri akachasị achọ (Naịjirịa) 1.Davido - Fem 2.Simi - Duduke 3.XXXTentacion - Bad 4.Betty - Butter 5.Rema- Ginger me 6.Rema - Woman 7.Burna Boy - Wonderful 8.Patoranking - Abule 9.Naira Marley - Tesumole 10.Davido ft Nicki Minaj - Holy Ground Ajụjụ ndị Naịjirịa kachasị chọọ gụnyere ajụjụ dịka kedụ etu e si eme achịcha Ajụjụ ndị mmadụ kachasị jụọ (Naịjirịa) 1.Who is the new President of America? 2.School resumption in Nigeria? 3.How to make hand sanitizer 4.Who is George Floyd? 5.How to make face mask 6.Who is Joe Biden? 7.Who is Laycon? 8.How to make cake 9.Who is Aisha Yesufu? 10.How to make bread? Ihe iri ndị ọzọ akachasị achọ (Naịjirịa) 1.Coronavirus 2.US election 3.Joe Biden 4.Google Classroom 5.ASUU 6.Zoom Live 7.Rema 8.Naira Marley 9.Rahama Sadau 10.Hushpuppi" afirika-47609096,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47609096,Onnoghen: Aka enwe banyere n'akwụkwọ mkpọpụta akụnaụba m,Ọkaikpe ukwu Walter Onnoghen tụrụ 'down' ka arụsị n'ụlọikpe ebe a na-enyocha ya maka ịgbanarị ịkpọpụta akụnaụba o nwere.,"Ka ọ pụtara n'ụlọikpe ""Code of Conduct Tribunal (CCT)"", o kwuru na ebubo e boro ya maka mmerụaka gbasara mkpọpụta akụnaụba ya esighị n'aka, na aka enwe banyere n'ofe. O kwuru nke a site n'ọnụ ọkaiwu na-anọchite ya bụ Adeboyega Awomolo SAN, onye kwuru na akwụkwọ mkpọpụta ahụ pụtara n'afọ 2014 na 2016 adịghị etu o kwesịrị ịdị. Dịka ndị Channels TV si kwuo, e higharịrị mgbe ọzọ Onnoghen ga-apụta n'ụlọikpe, buga ya n'ụbọchị 21 nke Maachị 2019, makana ha chọrọ ka onye na-elekọta akpaego Onnoghen gbaa n'ụlọikpe. Nke a bụ mbụ ọ na-apụta n'ụlọikpe kemgbe ọnwa Jenụwarị a kwụsịri ya ọrụ n'ike ma gbaa ya akwụkwọ. Ngagharịiwe na ""Trade Fair"" Ndigbo na-azụ ahịa na 'Trade Fair' Legọs emeela ngagharịiwe ma tie mkpu maka kepukepu na a chọrọ ịnaghara ha ọdọahịa ha nye nna ukwu ọzọ. N'okwu ya, onye nchikọta ndị ahịa ahụ bụ Tony Obih, kwuru na ha nụrụ na gọọmenti etiti chọrọ iwere ahịa ahụ nke ha gbazinyere ha nyefee n'aka ndị gọọmenti Legọs steeti. N'ofesi, Mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ itoolu merụrụ ahụ ka otu nwoke kwara mgbọ n'otu ụgbọoloko n'obodo Utretch dị na mba Netherlands. Ndị uweojii Utretcha wepụtara foto a bụ nke Gokmen Tanis, onye ha na-enyo kpara mkpamkpa a Ebe onyeisiala mba Mozambique bụ Filipe Nyusi, na-ekwu na ihe ruru mmadụ puku anwụọla kemgbe ajọ ifufe Idai wakporo mba ya. Ajọ ifufe Idai a si Mozambique mafere Zimbabwe ebe o gbukwara ọtụtụ mmadụ N'egwuregwu, Ngalaba UEFA eriala Cristiano Ronaldo iwu maka etu o si ṅụrịa ka o nyere goolu nke atọ ya ụbọchị ha dọriri ma chụpụ Atletico Madrid n'asọmpi Champions League. Nwoke ọzọ awụọla ndị mmadụ mgbọ na mba Netherland The uweojii jupụtara ebe ahụ ihe mere Ndị uweojii kwuru na otu nwoke gbasasịrị egbe n'ọdọ ụgbọoloko dị na obodo Utretch, gbuo otu onye ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ n'ụtụtụ Monde. O nwebeghị onye ha nwụchiri dịka a ka ji ụgbọelu atọ achọ nwoke ahụ kpara mkpamkpa ahụ. Ndị uweojii kwuru na ha na-enyo ihe mere dịka ""aka ọrụ ndị omekataraihepụụjọ."" N'ihe mere ndị obodo Utrecht kwụsịrị njem ụgbọoloko ganye n'udo alọghachị. 'Akwụ m chịm na PDP' - Jonathan Aka chịburu Naịjirịa dịka onyeisiala bụ Goodluck Jonathan azarala ọnụ ya n'akụkọ na-efegharị na ya agbajọọla ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ otu PDP mere ya ihe ọ bụ taa. Nke a na-abịa dịka a na-anụ kepu kepu na onye lekọtara achụmnta vootu Atiku Abubakar bụ Gbenga Daniels na-ekwu na ndị nkwado na-arịọ ya duru ha baa na pati APC. Ọkaikpe Onnoghen ga-awụchi n'ụlọikpe taa Justice Walter Onnoghen Ogbakọ otu ndọrọndọrọ CUPP akatọọla ihe ha kpọrọ mmaja ezighi ezi a na-eme onye bụbu ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen. Ha kwuru na ha nwere ihe akaebe ịgosi na ndị EFCC nakwa ndị uweojii gara n'ugbo Onnoghen ịmaja ndị na-arụrụ ya ọrụ iji mee ka o tinye akwụkwọ arụkwaghị m. Na mba ofesi, Praịm Mịnịsta mba New Zealand bụ Jacinda Ardern ekwuola na gọọmentị ya kwụdosiriike na mgbanwe achọrọ ịme iwu banyere ịbu egbe na mba ahụ. O kwuru nke a dịka akpụpụrụ Brenton Tarrant ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka mmadụ iri ise ọ gbagburu n'ụlọekpere ndị alakụba. N'egwuregwu, Aka na-achịkọta otu super Eagles nke Naịjiria bụ Gernot Rohr ejirila Ndifreke Effiong dochie Ola Aina dịka ha na-akwado ịchọpụta onye tozuru asọmpị iko mba Afríka. Gee akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49073313,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49073313,Dead vultures in Enugu: Ọ bụghị anụ ehi gburu udele nwụrụ n'Eke Ihe,"Ndị na-azụ ahịa n'Eke Ihe dị n'Awgụ, Enugwu steeti, ekwuola na ọ bụ eziokwu na udele karịrị ọgụ dara otu mgbe n'ahịa ahụ ma nwụọ ka ha richara anụ ụbọchị satọde, Eke gara aga.","Ehi ga-eberịrị 'moo' tupu e ree ya n'ahịa anyị Kama dịka ha si gwa BBC Igbo, ọ bụghị anụ nwụrụ anwụ ha riri gburu ha. Ha kwuru sị na ọtụtụ ndị mmadụ riri anụ ahụ, mana enweghi ihe ọbụla mere ha. Otu onye Ihe gwara onye ntaakụkọ BBC na a na-enyo na o nwereike bụrụ na achịnyere ụtaba n'ime eriri afọ ehi e wepụtara n'ime ehi ahụ nwụrụ anwụ, nke udele ndị ahụ riri tupu ha anwụọ. Onyeisi ndị na azụ ahịa n'Eke Ihe bụ Odinkemma Ebigbo, kwuru na o che na ọ bụ anụ nwụrụ anwụ ebe ọzọ tupu ebute ya n'ahịa Ihe butere ya bụ ọdachi. Mgbe BBC rutere Eke Ihe, ọ tọgbọ chakoo n'ihi na taa bụ ụbọchị 22 nke ọnwa Julaị abụghị ụbọchị Eke bụ ụbọchị ahịa ahụ na-azụ. Onye na-achụ nta n'Ihe bụ Fidelis Okeke, kwuru na ya adọọla ndị na-egbu anụ n'obodo ha aka na ntị n'oge gara aga banyere ire anụ amaghị ebe o si bịa. Fidelis Okeke na-achụ nta n'obodo Ihe Echiche mmadụ niile gbakọrọ n'ahịa ahụ ekwekọrịtaghi na ọ bụ anụ nwụrụ anwụ kpatara ọnwụ udele ndị ahụ. Ọtụtụ ndị obodo kwuru na ha chere na ọ bụ nsị ka e tinyere na ya bụ anụ were bute na be ha, ndị a rịọrọ ka gọọmentị chọpụta na ya bụ anụ enwereike igbu ndị riri ya. Ka akụkọ a pụtara na soshal midia, ụfọdụ ndị malitere ikwu na ọ bụ ndị Fulani na-achị ehi tinyere nsị n'anụ ehi ma bubata n'ahịa. Mana ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụghị ihe merenu, n'ihi na ọ bụ otu onye ehi nwụlahụrụ butere ya n'ahịa ka a bọọ ya ma ree ya. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo." afirika-45918371,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45918371,Nnamdi Kanu: 'Anyị ga-ekwu uche anyị' - Lai Mohammed,Lai Mohammed bụ Minista na-ahụ maka mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha ahụla ihe onyonyo Kanu,"O kwuru na ha dị nkwadobe ugbua ịzi ozi gbasara ya bụ ihe onyonyo nakwa Nnamdi Kanu n'onwe ya. Cheta na Kanu furu efu kemgbe awakporo ụlọ nna ya n'atụmatụ ""egwu eke"" n'ụbọchị 14 nke Sepụtemba afọ 2017. Kemgbe a hụchara ihe nkiri gosiri na onyeisi ndị otu Indigineous people of Biafra dị ndụ, ndị mmadụ kpụ okwu Nnamdi Kanu n'ọnụ. Content is not available End of Facebook post, 1 Onye ọkaịwụ ukwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru na ọ bụrụ ya ihe ọṅụ mgbe ọ nụrụ onu Nnamdi Kanu n'ekwenti. O kwukwara na oge na-adịghị anya, na Nnamdi Kanu ga-ekwu okwu n'igwe mgbasa ozi ka ụwa niile nụrụ olu ya ma mara arụ niile mere ụbọchị ndị agha Naịjirịa wakporo Ejiofor kwuru na ndị agha Naịjịrịa ga-agwa ụlọikpe ihe mere ha ji gbuo ihe ruru mmadụ iri na ise ụbọchị September 14, 2017 ha wakporo ụlọ nna Nnamdi Kanu. Mgbe BBC Igbo kpọrọ n'ekwenti ndị agha Naịjirịa ka ha nụrụ ihe ha nwere ike ikwu maka mpụta Nnamdi Kanu, ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Texas Chukwu ebughị ekwenti nke o ji a azaghachị ozi ezigara ya n'ekwenti. Onụ na-ekwuchitere ndị IPOB ọnụ bụ Emma Powerful kwetere na ha ahụla Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere na isi-aja Jerusalem. Powerful kwuru na obi bụ sọ ndị otu IPOB anụrị makana onyeisiaha dị ndụ. Ihe a na-ekwu n'elu soshal midia OgbeniDipo kwuru na ọgbagojuru anya na ndị agha Naịjirịa egbughị Nnamdi Kanu. WendyPrincea kwuru na onwere ihe di omimi so mpụta Nnmadi ugbua. ọ na-ayọkwa ka ndị Igbo leghara ya anya. MilkyJohny kwuru na ọ bụ ihe nnukwu ọṅụ na Nnamdi Kanu ka adị ndụ, nke a gosiri na Biafra a dila nso. Onye ndụ otu IPOB na mba Briten agwaala BBC Igbo n'ekwentị na Nnamdi Kanu dị ndụ. O kwuru na ihe onyonyo ahụ bụ nke ezi ya nakwa na Kanu n'onwe ya na-akwado ị gaa mba ofesi ebe ọ ga-anọ gwa ụwa niile okwu. Akụkọ pụtara n'oge gara aga na Nnamdi Kanu nke ahụbeghị kemgbe emere ""egwu eke"" na be ya apụtala n'ọha ugbua. N'ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia, o gosiri ebe Nnamdị Kanu na-ekpe ekepere na Jerusalem. Onye ndụ otu IYM bụ Elliot Ugochukwu Ukoh gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe onyonyo ahụ bụ nke ezi ya. Onye zitere ihe onyonyo a bụ Paul Achalla gwara BBC Igbo na Kanu ga-esi mba Jerusalem gaa mba Uk ụbọchị ụka na-abịa. BBC Igbo amaghị ka ihe onyonyo a ọ bụ ezie mana a na-elebakwa anya n'ihe gbasara ya. Cheta na mgbe BBC Igbo gbara nwunye ya bụ Uchechi Kanu ajụjụ, o kwuru na ọhụ beghị di ya kemgbe emere ""egwu eke"" Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51270177,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51270177,Gun Salute: Ihe ọghọm dị n'ịgbali egbe elu n'ebe a na-eme emume,"'A sị na ihe ọbụla lara elu ga lọtarịrị n'ala', etu a ka ọ dị mgbọ egbe a gbaliri elu.","Ọtụtụ mgbe ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ na-adị agbalikarị egbe elu n'obi aṅụrị karịsịa ebe a na-eme emume. Ụdị agwa a ebutele ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka mgbọ egbe a gbaliri elu tụrụ ha. Otu n'ime ndị nwụrụla a na-eche na ọ bụ n'ihi ịgbali egbe elu a bụ Ndubuisi Emenike, bụ onye pati All Progressives Congress (APC) n'Imo Steeti. Ọ nwụrụ site na mgbe tụrụ ya oge otu onye ọrụ nchekwa gbaliri egbe elu dịka ha na-aṅụ ọṅụ na mmeri nwada Princess Miriam Onuoha meriri na ntuliaka. N'ihi nke a, ka anyị lebanya n'ọghọm ndị dị n'ịgbali egbe elu. Kedụ ihe na-eme ma a gbalie egbe elu? Otu onye ọkachamara n'ihe banyere egbe na mgbọ bụ David Dyson sị na mgbọ egbe a gbaliri elu na a ga ogogo dị anya. Mana a naghị ama ebe ọ ga-ada, ohere dị na o nwereike ibute mmerụ ahụ maọbụ ọnwụ. Nyocha kwuru na agbanyeghi na ọsọ mgbọ egbe ji ada n'ala dị nta karịa nke o ji gbalie elu mana o nwereike ibute ọnwụ. N'ihi nke a ọtụtụ obodo dị n'ụwa dịka Califonịa, Texas, Arizona amachiela ndị mmadụ ịgbali egbe elu. Ihe mere ndị mmadụ ji agbali egbe elu Mgbọegbe Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu sị dịka omenala ndị si dị na a na-ahụta ya dịka nkwanye ugwu. Na ọ bụ mkpọnala ka a na-agbakarị mana ugbua ndị mmadụ malitere ịgbali egbe elu karịsịa ndị ọrụ nchekwa. O kwuru na nke a adịghị mma na o nwereike igbu mmadụ na ọ bụ imefu ngwa agha e kwesịrị iji rụọ ọrụ. Orlando si n'agbanyeghi na o nweghi iwu machiri ịgbali egbe elu na Naịjirịa mana e nwere ike ịkpọpụ mmadụ ụlọikpe maka ime ụzụ na ihe ndị ọzọ." afirika-46798617,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46798617,#Beyondfakenews: Buhari ariola ndị ntaakụkọ ka ha na-enyocha akụkọ tupu ha ebipụta ya,Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari akpọọla ndị ọrụ ntaakụkọ oku ka ha na-agba mbọ inyocha ma akụkọ ọ bụ eziokwu tupu ha ezipụ ya iji gbanarị akụkọ ụgha.,"Onyeisi BBC World Service bụ Jamie Angus nakwa Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari kwenyere na akụkọ ụgha na-emebi ihe n'obodo Buhari kwuru nke a oge onye isi BBC World Service bụ Jamie Angus gaara ya njem nleta n'obi gọọmenti dị n'Abuja. Onyeisiala kelere BBC maka ezi aha ha nwere ọkachasị n'oge obodo bụ igwe dịka oge agha Biafra. Ndi isi ọrụ BBC zutere Buhari n'obi gọọmenti etiti n'Abuja ""Site na itinye uchu n'inyocha akụkọ tupu ha ewepụta ya, BBC nwetara onwe ya aha dịka ụlọakụkọ anaghị ele anya n'ihu nke na ndị mmadụ tụkwasara ya obi."" Ka o si gaa na mkparịtaụka maka akụkọ ụgha Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa bịara ọgbakọ BBC mere n'Abuja ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2019 maka mkparịtaụka akụkọ ụgha ekwupụtala ụzọ ole na ole a ga-esi kwụsị mgbasa akụkọ ụgha na Naịjirịa. Osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo kwuru n'ọgbakọ ahụ sị, ""Ọ bụrụ na onweghị ihe e mere gbasara akụkọ ụgha, onweghịzị ihe a ga-ekweta na ọ bụ eziokwu n'obodo Naịjirịa"". O kwukwara na ọ ga-adị mma iwepụta iwu ga-achịkwa akara soshal midia. Ndị ọbịa bịara ọgbakọ a ji ohere a kwupute uche ha gbasara isiokwu a. Onye nkwuputeọnụ ndị Inec bụ Festus Okoye kwuru na ""iwu anyị nwere n'ala Naịjiria ezuola, anyị ekwesịghị ịwepụta iwu ọzọ ga-akpachi nka"" Odeakwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka, kwuru na ọ dị mma inyocha ozi ọbụla ị nụrụ ebe ọ bụla. N'ọnụ ya, ""ọ na-agbagwoju anya na onye chịgoro ọchịchị afọ asatọ ga-ekwu na otu ihe bụ ekwensu ma mecha sị na ihe ahụ bụ ihe enweghị ntụpọ ọbụla."" Uche Pedro nke Bella Naija sokwa na ndị tinyere ọnụ n'okwu kwuru na ndị dị afọ iri anọ, iri ise, iri isii na iri asaa ekwesịghị ịmepụta iwu banyere teknụzụ ndị dị afọ iri abụọ na iri atọ rụpụtara. Maka na ga-eji ya wee taa ndị mmadụ ahụhụ. Onyeisi ụlọọrụ BBC world service bụ Jamie Angus, kwuru na ụlọọrụ BBC ga-ewepụta ozi nyocha pụrụiche iche akụkọ ọ bụla pụtaranụ ọkachasị maka ntuliaka na-abịanụ. Eunice Atuejide bụ onye na azọ ọkwa isi ala kwuru na ""enwere ihe dị iche na akụkọ ụgha ya na okwu si n'echiche mmadụ pụta"" Onye ntorobia bịakwara ọgbakọ a kwuru ka gọọmentị etiti kwụsị iji akụkọ ụgha were na-agba akụkọ ụgha mgba. Onye ntorobịa ọzọ kwuru na gọọmentị kwesịrị ịnwe akara soshal media ka amara onye bụ onye n'eke akụkọ ụgha. Ihe mere eji ehibee ọgbakọ akụkọ ụgha Ụbọchị 16 nke ọnwa Febrụwarị bụ ụbọchị dị mkpa na Naịjirịa makana ọ bụ ụbọchị a ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu. BBC Afrịka ga-egosi mmadụ ihe niile gbasara ntuliaka a na Naịjirịa nakwa na gburugburu ụwa site n'elu Redio, ihe nkiri, n'ịntanetị nakwa soshal midia. Dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ịchụ nta vootu, a ga-enwe akụkọ ozi pụrụiche nke ndị BBC Afrịka ga-esi n'ụlọọrụ BBC News Igbo, BBC News Yoruba, BBC News Hausa, nakwa BBC News Pidgin, wepụta. Ọ ga-apụtakwa n'asụsụ Bekee na French. BBC Afrịka hibere ọgbakọ na-enyocha etu akụkọ ụgha na-esi agbasa nakwa etu ọ nwere ike isi metụta ntuliaka 2019. Emume a akpọrọ ""Nigeria 2019: Countering Fake News"" mere ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị. Lee ka o si aga na Facebook: Akụkọ ụgha ebutela ọtụtụ ọgbaghara ọkachasị nke metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mmekọrịta ndị mmadụ, nke mere na ụfọdụ ndị mmadụ anaghị eji ike enwe ntụkwasị obi n'elu akụkọ ozi. Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo, kwuru ihe bụ isiokwu n'ọgbakọ a. Adesuwa Onyenokwe bụ onye na-ebiputa akwụkwọ Today's Woman, bụ onye na-ajụjụ ndị na-akpa nkata ajụjụ. Ndị na-akpa nkata n'ọgbakọ a: Jamie Angus, bụ onyeisi BBC World Service Group kwuru sị: ""BBC News hibere ngalaba na-eme nyocha akụkọ na UK. Maka afọ 2018 m kpebie na mpaghara ụlọọrụ BBC ndị dị n'ofesi agaghị na-ekwu naanị maka akụkọ ụgha. ""Anyị malitere ime nyocha nyerela anyị aka ịghọta ihe na-akpalite ""akụkọ ụgha"". Anyị amalitekwala usoro ga-eme ka ndị Afrịka na India nwee ike inye ndị mmadụ akụkọ ziri ezi ma nwetakwa ozi bụ nke ezigbo ya.""" afirika-49745806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49745806,Pneumonia Disease: Gịnị ka ị ma gbasara ọrịa a?,"Kwa afọ, ihe karịrị ụmụaka dị otu nde na ụma isii (1.6 million) bụ ndị na-erubeghi afọ ise na-anwụ n'elu ụwaa n'ihi ọrịa ngụ Bekee kpọrọ 'Pneumonia'.","Onye ọrụ ahụike na-agba nwatakịrị ọgwụ mgbochi ọrịa 'Pneumonia'. Dịka ndị otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ 'World Health Organization' si kwuo, otu nwata na-anwụ kwa nkeji iri abụọ ọbụla n'ihi ọrịa ọjọọ a. Mana nke a apụtaghị na ọ bụ naanị ụmụntakịrị nwere ike ịrịa ọrịa ngụ, ọ na-emekwa ndị okenye. A bịa n' Afrịka, Naịjiria bụ obodo ọrịa ngụ kacha emekpa ahụ. Mana gịnị bụ 'Pneumonia'? Ngụgụ onye nwere ọrịa 'Pneumonia' dịka foto 'X-ray' si gosi. Theresa Nwachukwu, dibia bekee bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ụmụaka, kwuru na 'Pneumonia' bụ ọrịa ngụgụ. ""Ọ bụrụ na nje 'bacteria' maọbụ 'fungi' maọbụ 'virus' baa mmadụ na ngụngụ, nke a ka a na-akpọ 'Pneumonia'"". Nwachukwu kọwara na ọrịa ngụ dị icheiche n'ihi na nje na-akpata ha abụghị otu. N'ihi nke a, etu e si agwọ ya anaghị abụcha otu ihe. Iji maa atụ, ọ bụghị ọgwụ e ji gwọọ ọịọrịa ngụ nke nje 'bacteria' kpatara ka e ji agwọ nke 'virus'kpatara. Kedu ka e si ama onye nwere ọrịa a? Dkt Mohammod Jobayer Chisti onye mba Bangaladesh na-azọpụta ụmụntakịrị nwere 'Pneumonia'. Nwachukwu kwuru na ọrịa 'Pneumonia na-egosikarị onwe ya ma mmadụ na-enwe nhịahụ iku ume. Mgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala Ọ na-emekwa mmadụ oke ụkwara nakwa obi ịcha ọkụ. Nwachukwu kọwara sị: ""Nwa ọhụrụ dị ihe dịka izu isii na-eku ume ọkụ, ọkụ karịa ugboro iri isii n'otu nkeji (60 breaths per minute), nwere ike ịbụ 'Pneumonia' na-enye ya nsogbu."" E ji nka agwọ ọrịa obi ịdamba ""Ọ bụrụ nwa dị ọnwa atọ ruo ọnwa ise, okuku ume ya karịa ugboro iri ise n'otu nkeji (50 breaths per minute), o nwekwara ike ịbụ ọrịa ahụ."" ""Maka nwa gbarala otu afọ, okuku ume ya karịa ugboro iri anọ n'otu nkeji (40 breaths per minute), marakwa na ala adịghị mma."" O kwukwara na ọ bụrụ na nwata na-eku ume imi ya na- emepe emepe, nke Bekee kpọrọ 'flaring of the nostrils', o nwere ike ịbụ 'Pneumonia'. A bịa na ndị okenye, nke na-arịakarị ha bụ nke a kpọrọ 'Lobar Pneumonia'. Oyi anaghị akpata 'Pneumonia' N'ọnwa Febrụwarị afọ a, onyeisiala mba Brazịl bụ Jair Bolsonaro dara n'ọrịa 'Pneumonia' Nwachukwu kọwara na ọ bụghị oke oyi na-akpata ọrịa ngụ. Kama oyi nwere ike ịbọlite ya ma ọ bụrụ na mmadụ nweburu nje ahụ n'ime ahụ ya. Ụzọ mgbochi ọrịa a A na-agba ọgwụ mgbochi a ugboro anọ tupu nwata agbaa afọ abụọ. 1. Nke mbụ ma izu isii e jiri mụọ ya gachaa. 2. Nke abụọ bụ izu iri 3. Nke atọ bụ izu iri na anọ 4. Nke anọ bụ izu iri na ise. Ọgwụgwọ Pneumonia Onye ọrụ ahụike na-etinyere nwatakịrị nwere ọrịa 'Pneumonia' ikuku Ọ bụrụ nke nje 'bacteria' kpatara, a ga-enye onye ahụ ọgwụ Bekee kpọrọ 'Anti-Bacterial'. Ọ bụrụ nke nje 'fungi' kpatara, onye ahụ ga aṅụkwa ọgwụ 'Anti-Fungal'. Ọ bụrụ na iku ume na-ara onye ahụ ahụ nke ukwuu, e nwere ike itinyere ya ikuku nke Bekee kpọrọ 'Oxygen' ganye na o nweta onwe ya. Mana ihe ndị a bụkwa n'ụlọọgwụ ka a ga-enye ya ma e mechaa nnyocha zuru oke. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Code Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'" 45293499,https://www.bbc.com/igbo/45293499,#FreeOwerri112: Ụmụ Naijiria na-eti mkpụ ka a tọhapụ ụmụnwaanyị Igbo,"Kemgbe abalị asaa gara aga, ụmụnwaanyị ruru puku abụọ mere ngagharịiwe n'Owere ịji jụọ ebe Nnamdị Kanụ nọ, ihe karịrị otu narị na iri abụọ n'ime ha ka nọ na mkpọrọ.","Ndị uweojii na-ebo ha ebubo ịgbakọ n'aha otu a machiri amachị bụ Ipob nakwa igbosa udo obodo. Mana ụmụ Naijiria agbakaala n'iwe sị na ọ bụ mmegide ijide ndị na-eme ngagharịiwe n'udo, ebe ndị ogbu ọchụ na-akpagharị na-enweghị ihe e mere ha. N'okwu ya, @ChidiOdinkalu, onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye a ma ama kwuru na taa bụ Fraide nke abụọ ụmụnwaanyị ndị a ga-anọ na nga maka ịme ngagharịiwe n'obodo na-agba ndị ogbu ọchụ nkịtị. Odinkalu gara n'ihu kwuo na ndị uweojii nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a maka ebubo ịbụ ndị oyiegwu na ndị na akpa nkata megide gọọmenti n'ihi na ha mere ngagharịiwe na-eyighị akwa elu. @JulietKego kwuru na mkpọchi a kpọchiri ụmụnwaanyị n'Owere bụ ndị ezinaụlọ ha, ndị enyi nakwa obodo ha ka a kpọchiri. @fribone kwuru na enweghị ihe ụmụnwaanyị a mere nke megidere iwu ga-eme ka a nwụchie ma kpọchie ha na mkpọrọ. N'agbanyeghị nke a, onwebeghị ihe onyeisiala maọbụ Mịnịstri na-ahụ maka okwu ụmụnwaanyị kwurula maka ya. Ụfọdụ dịka otu @WomenAfrica35 na @SERAPNigeria na-ajụ ajụjụ ụdịrị gọọmenti nwere ike ijichị ụmụnwaanyị ikwu uche ha. Ndigbo nwere agba mechiri ọnụ Ụfọdụ na-egosi iwe na enweghị Ndigbo ọnụ na-erụ n'okwu dịka Ohaneze na ndị ọkaiwu Igbo nwere agba na-etinye ọnụ n'ọkwụ #FreeOwerri112." afirika-48167232,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48167232,Met Gala 2019: Ọgọdọ ụmụnwaanyị sụ bụ ọgbara Igbo gharịị,Ụmụwaanyị bịara Met Gala 2019 ekweghị ekwe site n'udiri uwe ha yi bịa ya bụ mmemme.,"Katty Perry buzị kpakpando nke igwe Met Gala bụ mmemme a na-eme kwa afọ kwa afọ nke ""Costume Institute Metropolitan Museum of Art"" dị na New york na-ahazi. E ji uwe na-achaba n'anya nakwa etu akwụkwọ ikike eji abanye ya si gaala ọnụ. Katty Perry kụrụ uwe dịka nri n'onyonyo a si akara twitter ya Celine Dion sị ka ya ghọọ tolotolo Cardi B yi uwe dịka ọkụ si n'ime ugwu apụta Uwe ndị be Kim Kardashian kụrụziri bụ ụwa bịa lele Lekwa ka ezinụlọ Kardashian na siri jikere bịa Met Gala 2019 Lupita nyongo puziri nku sị ka ha fee Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56654500,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56654500,IG Usman Alkali Baba: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisi Uweojii Naijiria ọhụrụ,Onyeisiala Muhammadu Buhari emeela Usman Alkali Baba onyeisi ndị uweojii Naịjiria ọhụrụ.,"Ozi si n'aka minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Maigari Dingyadi pụta n'Abuja taa (06/04/2021) gbara ama na ọ malitere ọrụ ozigbo. Baba na-anọchi Mohammed Adamu bụ onye e sepụrụ oche n'otele dịka ọ gara njem ọrụ n'Owerri. End of Twitter post, 1 Alkali Baba bụbu osote onyeisi ndị uweojii tupu e nye ya ọkwa ọhụrụ a ka ọ malitere ozigbo. A mụrụ ya afọ 1963 na state Yobe. Ọ gara ụlọakwụkwọ dị elu na mahadum 'Bayero University Kano' nakwa Usman Dan Fodio University dị na Maiduguri. O sonyere ụlọọrụ ndi uweoji na afọ 1988. Usman Alkali Baba nwere nzere Masters na agụmakwụkwọ Public Administration nakwa Political Science . O so n' otu ndi gụrụ n'ụlọakwụkwọ 'National Defence College' nakwa otu 'International Association of Chiefs of Police. Ọ bụbu onyeisi ndi uweojii Zone 7 Markudi na Zone 7 Abuja ma bụrụkwa onye kọmishọna ndi uweojii n' Abuja nakwa Delta steeti. Nwafọ Yobe steeti, Baba rụkwara ọrụ dika onye odeakwụkwọ ndi uweojii tupu a họpụta ya dika Osote Onyeisi gburugburu(AIG) ndi uweojii n' abalị atọ nke ọnwa Nọvemba 2020." afirika-49492999,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49492999,US Visa Fee: Lee ego ole ọ ga-efu gị inweta 'visa' Amerịka,"Malite n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ọnụ ego e ji enweta ""visa"" mba Amerịka ga-arị.","Nke a bụ ozi ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka wepụtara n'ụbọchị Tuuzde. Ha kọwara na iwu ala ha kwuru na ha ga-akpaso mba ọbụla agwa etu mba ahụ si akpaso ha agwa. E mee e megwara anaghị apụ okwu Onyeisiala Naịjiria Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Amerịka Donald Trump Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kọwaa, a na-ana ndị mba Amerịka ego dị elu tupu ha enweta akwụkwọ ịbata Naịjirịa. ""Ọnụ ego ọ na-ewe onye Amerịka inweta ""visa"" Naịjirịa dị elu karịa ọnụ ego ọ na-ewe ndị Naịjirịa inweta ""visa"" Amerịka."" ""Kamgbe mbido afọ 2018, gọọmentị Amerịka na-arịọ gọọmentị Naịjiria ka a gbanwee nke a."" ""Mana dịka ọnwa iri na asatọ gachara, gọọmentị Naịjirịa agbanwebeghi ya."" ""Nke a mere ngalaba a kpọrọ ""U.S. Department of State"" wepụta ọnụ ego ọhụrụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ na ""visa"" Amerịka."" Akwụkwọ ozi ahụ kọwakwara na ọbụ naanị ndị akwadoro ""visa"" ha ga-akwụ ụgwọ ọhụrụ a e tinyere. Onye ọbụla akwadoghi ""visa"" ya agaghị akwụ ya. Ọ gakwara n'ihu kọwaa na onye Naịjirịa ọbụla ga-akwụrịrị ụgwọ ọhụrụ a tupu e nye ya ""visa"" ọhụrụ, agbanyeghi obodo ọbụla onye ahụ nọ wee tinye akwụkwọ. Ma nwata ma okenye ga-akwụrịrị ya bụ ụgwọ. Ọ bụkwa n'ụlọ ""embassy"" nke Amerịka ka a ga-akwụ ụgwọ ahụ, ọbụghị n'ụlọ akụ. Ego ole bụ ""visa"" Naịjirịa Onye Amerịka chọrọ ịbịa Naịjirịa ga-akwụ $160 (N59,200) iji gbata ""visa"". Ọ bụrụ onye bịara ịrụ ọrụ, onye ahụ ga-akwụkwa $160 ọzọ iji gbata ikike a kpọrọ ""Temporary Work Permit"" (TWP). E nwekwara ego ọzọ ($160) nke a kpọrọ ""Subject to Regularization (STR) Visa Fees"". Ha niile pụtara $480 (N177,600) ma ọ bụrụ onye Amerịka bịara ịrụ ọrụ na Naịjiria. Onye bịara naanị maka nleta maọbụ nlereanya ga-akwụ $320 (N118,400). N'agbanyeghi ego ndị a, ego Amerịka na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata, pekarịrị ego ole ndị mba Briten na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata. Lee ihe gosiri nke a: Dịka ukvisa.blog si dee n'ọnwa Epreelụ nke afọ 2019, Naịjiria na-akwụ dọla 129 maka visa Briten, mana ọ bụ dọla 121 n'ọnwa Ọgọstụ Ego ole ka ""visa"" Amerịka bụ? Lee ego ole a gbakwunyere na ọnụ ego ""visa"" Amerịka. Otu dọla pụtara N370 dịka ha sị tụgharịa ya. Visa B1/B2 bụ nke a na-enye ndị na-aga Amerịka maka azụmaahịa, ebe F1/F2 bụ nke ụmụ akwụkwọ. Ọnụ ego ha bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $110 (N40,700). Nke a pụtara na onye e nyere visa a ga-akwụzi $270 (N99,900). Visa ogoogo ""H"" bụ nke nwa mgbe nta a na-enye ndị ọrụ kwa mgbe maọbụ ndị gara ọzụzụ na-agaghị anọte aka. Ọnụ ego ya bụ $190 (N70,300). Ugbua, agbakwụnyela ya $180 (N66,600), nke pụtara $370 (N136,900). I ga-ahụ ọnụ ego ndị na webụsaịt ndị ụlọ nnọchite anya Amerịka na Naịjiria. Visa ogoogo ""I"" bụ nke a na-enye ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ mgbasa ozi. Ọnụ ego ya bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $210 (N77,700), nke pụtara $370 (N136,900). Visa ogoogo ""L"" bụ nke a na-enye ndị ụlọọrụ ha wegara na mba Amerịka (Intracompany Transferees). Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $303 (N112,110), nke pụtara $493 (N182,410) Visa ogoogo ""R"" bụ nke a na-enye ndị ọrụ okpukperechi. Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $80 (N29,600), nke pụtara $270 (N99,900). Ihe ndị mmadụ na-ekwu Ndị mmadụ na-etinye ọnụ na mbuli ọnụ ego ""visa"" a. @adeyanjudeji kwuru na ụmụ Naịjirịa ga-amarịrị ihe. @paul_nwachukwu kwuru na nke ahụ gosiri na onweghizi mba na-akwanyere Naịjirịa ugwu. Mana @woyet kwenyere na gọọmentị Naịjirịa bu ụzọ chọọ okwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka." mba-uba-48340001,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-48340001,Ukraine President: Enwere m ike ịchị Naịjirịa dịka onyeisiala - Basket Mouth,"Dịka ọ bụ ihe egwuregwu, nwafọ mba Ukaraine na-akpa ndị mmadụ ọchị a kpọrọ Volodymyr Zelensky abụrụla onyeisiala mba ahụ.","Volodymyr Zelensky bụ ọkaiwu dị afọ iri anọ na otu tọgbọrọ asambodo ya wee banye n'ịkpa ọchị, tupu ọ zọọ ọkwa ma merie dịka onyeisiala. N'aka nke ọzọ Onye ọkpa ọchị ama ama na Naịjirịa bụ Basket Mouth ekwuola na ọ ga-achịnwu Naịjirịa nkeọma ma ọ bụrụ na e nye ya ohere. O kwuru na ọ ga-emeli nke a maọbụrụ na ewepụ ụfọdụ ihe na-emebi ndọrọdọrọ ọchịchị na Naịjirịa dịka okpukpere chi, ikpa oke na ihe ndị ọzọ. Basket Mouth mekwara ka anyị ghọta na ndị ọkpa ọchị bụ ndị nwere amamihe ma burukwa ọ dị mma Naịjirịa n'obi. O kwuru na ha n'elezi anya n'ihe na-aga n'ododo ma were ya mee ihe ọchị dịka ụzọ iji kuziere ndị mmadụ etu obodo anyị siri dewe isi. O kwuru si n'agbanyeghi aka ọrụ mmadụ, onye ghọtara ihe butere nsogbu Naịjirịa ga-achịnwu Naịjirịa nke ọma. Basket Mouth, onye ezigbo aha ya bụ Bright Okpocha so n'otu n'ime ndị malitere ịkpa ọchị na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 46578156,https://www.bbc.com/igbo/46578156,Climate Change: Mbaụwa etinyele aka n'akwụkwọ maka ịzọpụta ụwa,Ọṅụ juputara ndị mbaụwa obi ụbọchị Satọde ka emechara tinyezuo aka n'akwụkwọ maka nkwekọrịta ịbenata anwụrụ kabọn nke sọ eme na okpomọkụ na-egbu mmadụ n'ụwa ugbua.,"Michal Kurtyka Onyeisila mba Poland ka ọ na-aṅụrị mgbe etinyezuru aka n'akwụkwọ Akwụkwọ a gosiri na a ga-amalite ya bụ atụmatụ n'afọ 2020. Nkwekọrịta mba niile n'okwu a adịghị nfe nke mere na o eji otu ụbọchị gafee ụbọchị ekwesiri ịweta ya bụ nzụkọ na njedebe. Ndị bịara ya bụ ọgbakọ kwenyere na ihe dị na ya bụ akwụkwọ ga-eme ka onye ọbụna so na otu mbaụwa a mezuo ihe ha kwere na nkwa. Nkwekọrịta Katowice ga-enyeaka imezu ebumnobi nke e mere na Paris bụ nke ga-eme ka okpomọkụ belata n'ụwa gbadaruo 2'C. Michal Kurtyka bụ onyeisi COP24, dịka akpọrọ ya bụ nzukọ n'aha ịchafụ sị na ""ịhazigharị ya bụ nkwekọrịta Parịs abụghị asụ anwụru"". ""Ya bụ ọrụ adịghị nfe, mana anyị nwara ike anyị ịhụ na onye ọbụla tinyere ọnụ na ya bụ okwu"". Ndị mba na-emepe emepe chọrọ ka ụwa nụ olu ha ma ka a kwụọ ha ụgwọ ahụhụ ha na-ata maka okpomọkụ ụwa. N'agbanyeghị, ndị mba mepere emepe ekweteghị na ọ bụ ha mere ụwa ji ekpo ọkụ maka oke ụgwọ ha nwere ike ịkwụ ndị na-emepe emepe. Akwụkwọ nchọpụta kwuru na-aghọtaghịzị ebe ụwa chere ihu ebe okpomọkụ na-achọzị ịgafe 3'C. Iwedata ya bụ ọnụọgụgụ ga-agbanwe ka anyị si ebi ndụ n'ụwa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44422955,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422955,Obasanjo: Ndị Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu,Ndị mmadu nọ na soshal midia Naịjirịa na-etinye ọnụ na mkpu onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo tiri na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari chọrọ ịnwụchịkọ ma bo ya ebubo maka nkatọ ọ na-eme gọọmentị ya.,"Obasanjo chịị ala Naịjirịa afọ asatọ tupu onyefe Yar'adua Ụnyaahụ, Obasanjo sị na ozi ya nwetere na-ekwu na ndụ ya enweghịzị nchekwa makana ndịọrụ nchekwa Naịjirịa bu ya n'uche. Obasanjo, n'ime ozi o dere, kwuru na ndị ọgba ama ya nọ na ""ngalaba dị icheiche na ọrụ nchekwa Naịjirịa"" na-agwa ya gọọmentị na-achọ ịgwa ndị na-ahu maka mpụ na awụwọ akpọrọ ""Economic and Financial Crimes Commision"" (EFCC) ka ha mepe nchọpụta banyere etu o shị chị a Naịjirịa site afọ 1999 were ruo 2007. Obasanjo si na ọ bụ makana ya na-ekwu eziokwu ka gọọmentị jiri na-achọ ịpịchị ya ọnụ, ma gakwa n'ihu kwuo na: ""Anyị nọ na obodo onye bụ nke atọ na gọọmentị bụ onye a na-emekpa ahụ, ka onye nke anọ na-ahụkwa otu ihe ahụ site n'aka gọọmentị ha na-agbara odibo."" Ọ si na ihe niile na-eme maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019, bụ nke enwereike ji ""chụmie, merụọ ahụ maọbụ gbuo ndi mmadụ."" Mana gọọmentị Naịjirịa sala Obasanjo were si na ọ bụ sọsọ onye aka ya adịghị ọcha ga na-atụ ụjọ. Ka ha na-agọ na ha enweghi ebunnobi ịnwụchịkọ Obasanjo, gọọmentị Naịjirịa, site n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha bụ Lai Mohammed, jụrụ ihe mere ojiri bụru ka Buhari kwanyere MKO Abiola ugwu ka okwu a na-apụta. O kwukwara na gọọmentị ha agaghị achụ onye ọbụla aka ya dị ọcha. N'elu soshal midia ụfọdụ mmadụ na-etinye ọnụ na ya bu okwu, ma na akwado maọbu na akatọ Obasanjo. Nicholas Ibekwe dere ihe dara ka nke ndị gọọmentị dere maka okwu a mgbe ọ sị na so ihe Obasanjo hụrụ ọ ga-eji me ka ndi mmadu chefuo ihe Buhari mere Abiola na ndị ọzọ bụ ịsị na a na-achụ ya. Ka @nnekei dere okwu ụfọdụ si na Obasanjo kwuru mgbe Buhari na-azọ ọchịchị na 2015, iji gosi na ọ dika ihe okwuru mgbe ahụ na-eme ụgbụa. Ka @Ediong na-akọwa na-ọdịghị mfe ịnwụchị onye bụbụ onyeisiala, maka ọ bụru na ọ bu etu a, Goodluck Jonathan ga a nọ na mkpọrọ. Ka otu pati ""Peoples Democratic PARTY"" (PDP) bụ ndị Obasanjo jiri akara ha chịa Naịjirịa sị na ihe a o kwuru na-atụ ajọ egwu, makana ọ dịzị ka Naịjirịa bụ ebe onye ekwenyeghị na Buhari ga-enwe nsogbu. Gimba Kakanda dere na okwu Obasanjo dị ka okwu onyeisi ndị omeiwu Naịjirịa bụ Olusola Saraki mechara nwe eziokwu, dika onwere ndị kpọrọ aha ya mere ndị uweojii jiri si ya zara aha ya. Ihu na azụ a ka na-aga n'ihu na soshal midia, nke mere aha Obasanjo jiri na-ewu na Twitter." afirika-54202448,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54202448,Ihe mere ụmụnwaanyị anaghị eketa ala n'omenala Igbo,Atụmatụ ike akụnaụba n'ime ezinaụlọ bụ atụmatụ zuru mbaụwa niile ọnụ nke ndị Igbo so na ya.,"A bịa n'ala Igbo, ihe a na-akpọ atụmatụ ike akụnaụba bụ ""Ike Ekpere"" nke gụnyere ụlọ, ala, ụgbọala, uwe nakwa ihe ndị ọzọ. Ebe akụkọ a na-elekwasị anya bụ etu ndị Igbo si eke ala n'ụzọ omenala, mana ọ ga-ebuzo kọwaa ihe bụ ala. Kedụ onye na-eketa ala n'omenala Igbo Onye ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo na Mahadum Legọs bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na ike ala n'omenala Igbo abụghị ma ụmụnwaanyị, na ọ bụ naanị ụmụnwoke na-eketa ala. Ọ sị nke a bụ makana ndị Igbo kwenyere na nwaanyị ga-esi n'ezinaụlọ ya pụọ ga-enyere di ya aka wulite ezinaụlọ nke ha. Ọ sị na ọ bụrụ na e kenye nwaanyị ala n'ụlọ nna ya, na anya nwaanyị ahụ agaghị anọgide n'ụlọ di ya, na obere ihe na ọ ga-agbalata. Nnabuihe katọrọ ikpe ahụ a chabiri na nso nso nke sị ka amalite ikenye nwaanyị ala, na nke megidere omenala Igbo. Ọ sị na nke a bụ ihe ọ gbara ọhụrụ na abụghị etu omenala Igbo si na mgbe gboo. Gịnị bụ Ala? Ndị Igbo kwenyere na ala bụ otu n'ime ihe onyinye Chineke ji chọọ ụwa mma, nke o nyere ndị nna anyị ochie. Ala bụ otu n'ime ụzọ e ji enweta akụrụ ngwa ndị e ji ebi ndụ dịka ihe a kụrụ n'ugbo, ịrụ ụlọ obibi na ngwupụta ihe ọ natarachi. Ndị Igbo na-efekwa ala ka chi, bụ nke na-arịọ ya ka o nye ha onyinye nwa, mpụrụosisi na uwe ihe ubi dị iche iche. Kedụ ụzọ ndị e si enwete ala? Mmadụ nwereike inwete ala site n'ụzọ ndị a: Ihe nketa: Nke a bụ ala ndị eketara dịka ịbụ otu n'ime onye si n'ezinaụlọ. A na-atụ anya na nwa ga-eketa ala n'aka nna ya. Ọzụzụ: Nke a bụ ala ndị e nwetere site n'ọzụzụ. Mgbe mbụ a na-ahụta ire ala dịka arụ nke mere na ọtụtụ obodo n'ala Igbo anaghị ere ala ere mana nke agbanweela n'ụfọdụ obodo. Mgbazinye: Ọ bụ ala agbazinyere mmadụ n'ime afọ ole na ole ka o were ya rụọ ọrụ ugbo maọbụ mee ihe ọzọ. Mgbanwe: Nke a bụ mgbe mmadụ abụọ nwere ala kpebiri ịgbanwe ala ha nwere n'etiti ha abụọ iji mee ka ọ dịrị ha mfe. Onyinye: Nke a bụ ala a natara site n'onyinye, onye na-abụghị otu n'ime ezinaụlọ nwereike ikete ala dịka onyinye. Kedụ etu ndị Igbo si eke ala? Onye ọkammụta n'asụsụ na omenala Igbo bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na mpaghara Igbo dị iche iche nwere etu ha si eke ihe nke gụnyere ala. Ọ sị na ụfọdụ ndị dịka Ohafia, Edda na-eke n'ikwu nne, ọtụtụ ebe ndị ọzọ na-eke n'ikwu nna. ""N'ezinaụlọ nwere di na otu nwunye, na ọ bụ diọkpara na-eketa obi nna ya na o nweghi onye na-azọ sị ya okeala ahụ kama na ọ bụ ọrụ ya ịnọ n'obi nna ya hụ na ụmụnne ya ndị ọzọ agaghị ehi n'ezi. N''aka nke ọzọ na ọ bụ nwa nke ọdụ nwe okeala ebe ahụ usekwu nne ya nọ, ebe ụmụ ndị ọzọ ga-eketa ala ndị ọzọ."" Nnabuihe sị na ọ bụrụ ezinaụlọ nwoke lụrụ ọtụtụ nwunye na a ga-ebuzọ kenye diọkpara obi nna ya tupu e kee ala ndị ọzọ n'isi nwunye ya ndị mụtara nwoke. Mgbe nke a mechara na ụmụnwoke ole otu nwaanyị mụrụ ga-aga kee ala nke ha n'agbanyeghị ole ha dị. Nnabuihe sị mgbe ụfọdụ nwoke na-eke ala etu o si maasị ya tupu ọ nwụọ. Mana ọ bụrụ na etu o si kee ya adịghị mma, na ndị ụmụnna ka e kegharị ala ma ọ nwụọ, nke mere e ji a sị "" Onye nwụrụ anwụ kechaa ekpe ndị dị ndụ ekegharịa"". N'Imo Steetị, Maazị Achonna John-Okere sị n'obodo Imerienwe, ọ sị na ọ bụ di ọkpara nwee obi nna ya. Na a na-ekezi ndị ọzọ n'isi ụmụnwoke ole nọ n'ezinaụlọ. Ọ sị na ọ bụrụ nwoke lụkwara ọtụtụ nwunye na ọ bụ n'isi nwunye ole ọ mụrụ ka a ga-eji keere ụmụ ya ala. Kama na ọ bụrụ na o nwere onye obi adịghị mma etu e si kee ala na onye ahụ ga-eme mkpesa n'obieze ka ha kpee ikpe dị n'ala ahụ. John-Okere sị na ọ bụrụ na Eze na obi ya ekpeteghi ya na onye ahụ nwere ị ga ụlọikpe ọdịnala a kpọrọ 'Customary Court'. N'obodo Nkwe dị n'Ọgwụ nke Enugwu Steetị, Maazị Laz Udogwu sị na ọ bụ ụzọ atọ ka ha ji eke ala n'obodo ahụ. Nke mbụ bụ na nwoke nwereike iji aka ya eke ụmụ ya ala dịka o si maasị nakwa etu ụmụ ya si kpasị ya agwa mana ọ bụ diọkpara ga-eketa obi naa. Nke abụọ bụ na site n'ịhọrọ ala (Balloting); ebe a ga-enye ala niile ahụ akara ma kpọkọta ụmụ ya ha bịa ghọrọ akara ndị a malitena diọkpara ya. Akara ọbụla onye họtara ga-abụ okeala ọ ga-eketa n'aka nna ya. Nke atọ abụrụ na a gụkọchaa ala ndị ahụ ọnụ ma nye ha akara ndị ụmụnna ga-ehiwe kọmitti ga-eke ala ndị a n'etiti ụmụ nwoke ahụ. Ndị kọmitii a ga-abụkwa ndị akaebe ma ọ bụrụ nsogbu ọbụla adapụta n'etu e si kee ala ndị ahụ. Na nchịkọta, mpaghara ala Igbo dị iche iche nwere usoro ha ji eke ala mana ihe gbapụtara ihe n'ime ha niile bụ na diọkpara na-eketa obi nna ya ebe nwa ọdụ na-eketakarị usekwu nne ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-45080828,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45080828,IPOB agbahapụla Nnia Nwodo na Ben Nwabueze,Ipob si na nzụkọ ehibere n'etiti ha na otu NdiIgbo ndị ọzọ pụọ ụnyaaahụ.,"Na nzụkọ ahụ, ha kwuru na sọsọ ihe ga-ebute udo n'etiti ha na gọvanọ ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ ịwepu aha ọjọọ akpọrọ Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu. Ihe ọzọ Ipob kwuru bụ na ha chọrọ nkwụsị mmegbu ndị otu ha dịka ndị dara iwu ala nakwa ịkwụ ndi otu ha nwụrụ n'egwu eke nke ndị agha Naịjirịa ụgwọ itiaka n'obi. Ha kwuru ihe ndị a na nzụkọ ahụ mere n'Atani bụ ụlọ Ben Nwabueze so n'otu 'Igbo Leaders of Thought' dịka ụlọ ntaakụkọ Guardian siri kwuo. A na-anụ kepu kepu na nzụkọ a gwụrụ n'ọgbaaghara ebe ndị Ipob ji iwe pụọ na nzụkọ ahụ. Lee ebe Radio Biafra kwuputara ya n'akara soshal midia ha na nke a mere n'ezie. Mana a na-anụ na ndị Ipob, Ohaneze Ndịgbo nakwa gọvanọ dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ ga-enwe nzụkọ ọzọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa ọgọst." afirika-46375826,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46375826,2019 Africa Cup of Nations: Cameroon agaghị ahazi ya,Confederation of African Football (Caf) ekwuola na Kamerun agaghị abụzị obodo ga-ahazi asọmpi ahụ nke afọ a.,"Onyeisi Caf bụ Ahmad Ahmad si na a ga-ahopu mba ọzọ tupu afọ a agwụ Caf sị na ha napụrụ Kamerun nhazi a maka oge ha na-egbu na nkwado asọmpị a ga-ebido n'ọnwa Juun nke afọ 2019. Ndị na-achị Caf nwere nkwekọrịta a na nzukọ ha mere n'isi obodo Gana bụ Accra. Onyeisi Caf bụ Ahmad Ahmad sị ha ha ga-agba mbọ ""inweta mba ọzọ ga-ahazi asọmpi a tupu afọ a agwụ"". Mba Afịrịka 24 ga-eso n'asọmpi a ga-ebido n'ọnwa Juun na Julaị. Ahmad kwuru n'ime afọ 2017 na Kamerun ka kwesịrị ""ime ka Caf kwere na ha nwere ikike"" ihazi asọmpi a, ka mba ahụ na-ekwu na ha zuru ka e mee. Mana n'ime Ọgọst 2018, Amaju Pinnick, bụ onyeisioche ngalaba nhazi na Caf sị, ""onweghi onye ga-anapụ Kamerun asọmpi a"". E kwuburu na ọ ga-abụ mba Moroko ka a ga-enwe nhazi a, site etu ha si pụta hazie nke afọ mgbe a napụrụ ya Kenya n'aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43919211,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43919211,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Kwụsịnụ ịchị ehi agagharị - Gọọmentị,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Gọọmenti etiti egbochiela ịchịgharị ehi malite na Steeti ise,"Ndị isi ọchịchị bụ National Economic Council ekwerikọtala igbochi njem ndị na-achị ehi nke ga-amalite na steeti ise dịka Benue, Taraba, Adamawa, Kaduna na Plateau. Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi kwupụtara nke a na ngwụcha mkparịta ha nwere n'Abụja ụnyaahụ. Ipob akatọọla gọọmenti etiti banyere Osita Chidoka na Enyinnaya Abaribe Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra Otu Ipob agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị ịchụgharị onye bụbu Mịnịsta ụgbọelu bụ Osita Chidoka na Sịnetọ Enyinnaya Abaribe maka itinye aka n'akwụkwọ nnapụta Nnamdị Kanu. Nke a dị n'ozi Onye ode akwụkwọ otu a bụ Emma Powerful wepụtara ụnyaahụ Akụkọ ndị ga-amasị gị: Kim Jung-un mba Nọt Korịa agala Saụt Korịa Onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-un abụrụla onye ndu ndị Nọt Korịa mbụ ga-amanye ụkwụ na mba Saụt Korịa kamghe alụchara agha Korịa n'afọ 1953. Kim Jong-un gafere ebe ya ogbo ya nke Saụt Korịa bụ Moon Jae-in kwere n'aka ma zọpụ njem mkparịta ụka. N'egwuregwu NFF na Gọọmenti Rivers Steeti ekwuola na ndị Supa Igụls ga-ele ndị DR Congo ọbịa n'asọmpi enyi na enyi na Portharcourt n'ime ọnwa ọzọ N'ọzọ, Arsenal na Atletico Madrid nyeritara onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asọmpị Uefa Europa ha gbara ụnyaahụ. Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ọrịa kansa abụghị ikpe ọnwụ Onye meriri ọrịa kansa" afirika-43355718,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43355718,Imo steeti: Okorocha ọ pụrụ imeli ọgọ ya Gọvanọ?,Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola kwusie ike na ọ bụ Uche Nwosu bụ di nwa ya nwaanyị ga-abụ onye ga-anọchi anya ya dịka Gọvanọ steeti ahụ ma ya pụọ n'ọchịchị.,"Rochas Okorocha nọ n'agba nke abụọ dịka Gọvanọ Imo steeti Nwosu kwere ndị Imo steeti nkwa na ọ gaghi ekwe ka nna ya ukwu chịa ya dịka ọ bụ omenaala na Naijiria na onye emere eze na-efe onye mere ya eze. End of Twitter post, 1 Okorocha kwuru na okpuru ọchịchị iri abụọ na anọ n'ime iri abụọ na asaa dị na steeti ahụ kwadoro ebunauche ya ahụ. Mana ụfọdụ na-ekwụ ihe ndị Okorocha mere kemgbe ọ chịwara bụ ihe ga-akwada ọgọ ya. Kemgbe afọ 2015 Owelle Rochas Okorocha banyere ọchịchị nke ugbo abụọ, ọ bụ ọsọ ndị, owe ndị n'Imo steeti maka ọchịchị ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nke a bụ maka na ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ọchịchị ya achịtaghị aja ọbụla n'Imo steeti n'ihi na ọtụtụ ndị ọrụ na steeti ahụ na-ebe akwa ụgwọọnwa ha. Ndị lara ezumike nka, ndị ọkaikpe, ndị ọrụ ahụike na ndị ọrụ ndị gunyere ndị a chụrụ achụ emegidela ngagharị iwe, ike agwụ ha. Mana oge ọbụla, ọ bụrụ na ọ naghị akpụ mmadụ, ị mara na ọ na-eme mmemme nkwarị otu ebe maọbụ ebe ọzọ. Otu ihe mmadụ niile kwekọritara bụ na ndu na-atọ Okorocha ụtọ mana o chekwara na ndụ na-atọ ndụ ọ na-chị ụtọ? Ogbochi isii dịrị Okoroocha na imezu ebunauche ya Tupu Okorocha enwe ike imeli ọgọ ya gọvanọ Imo steeti, o nwere ọtụtụ mmiri ọ ga-egwu na ugwu ọ ga-arị. Ha gụnyere: 1: Ufodụ na-ekwu na o mere Imo steeti ka ọ bụ akụ ezinaụlọ ya site na otu o siri eke ọrụ na steeti ahụ. Uche Nwosu bụ dị nwa ya nwaanyi onye ọ na-agba mbọ ka ọ nọchie ya dịka gọvanọ bụ ọnyeisi ọrụ nke a kpọrọ Chief of Staff, nke steeti Imo. Okorocha meree nwanne ya nwaanyi bụ Ogechi Ololo, Kọmishọna na-ahụ maka aṅụrị. 2: Ọgbaghara dị na APC Otu pati ya bụ APC nwere ọgbaraghara n'etiti na steeti ahụ. Ụfọdụ ndị nọ na pati APC n'Imo steeti ekwenyeghị n'ihe Okorocha chọrọ iji akaa ya họpụta onye ga-achị steeti ahụ. Dika o si aga, osote Govanọ bụ Prince Eze Madumere onye sokwa n'otu APC ekwupụtala mmasị ya ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ. 3: Ndị Okorocha mejọrọ Karịrị akarị Ọtụtụ ndị Okorocha mejọrọ anaghị ekwe ka a kpọta ha ya ma ya fọdụ ikwụnyere onye ọ họpụtara nọ ọchịchị. ha gụnyere Ndị na-azụbu ahịa n' ahịa Ekeukwu dị na Owere ebe ndị uweojii gbagburu otu nwata nwoke oge ha na-agbali egbe elu iji gbasa ndị mmadụ mgbe a na-emebi ahịa ahụ. ndị ọzọ bụ ndị ọrụ oyibo ndị a na-eji ụgwọ ọnwa 4: Ebubo na Okoroocha na-emefu ego n'ihe adịghị mkpa Ịkpụ nkwu ndị a na-enyo enyo Okoroọcha kpụrụ akpụrụakpụ Jacob Zuma onyebụbu onyeisiala Saut-Afrika nke achụturu n'ọchịchị maka mmerụaka. Ihe dịka idozi ihe Ekeresimesi, ime achịcha bekee ịrị abụọ na anọ maka ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. 5: Ndị ụka Katolik akwadoghị ebumnuche ya. Na nsonso, Bishop Ọbinna nke Owere Katolik Diocese katọrọ nkata Okoroocha na-akpa ime ọgọ ya Gọvanọ, nke mere ka ndị otu Okoroocha palite obere ọgbaghara ebe ọ na-aka ụka. Agwa yiri ihe ndị otu Ikedi Ohakim mere nke mere ka ịzọ Okwa gọvanọ nke agba nke abụọị danye na mmiri. 6: Anya ndị ọzọ nwere agba na steeti ahụ nọ na pati ndị ọzọ dịkwa n'ọkwa Gọvanọ. Ndị dịka Senator Ifeanyi Araraume nke PDP chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ na- ekwu na agaghị ahapụrụ otu onye steeti ka ọ na-ekwu ihe na-eme na ya. mana na mkparịta ụka ya na BBC igbo nwere na nsonso, ọkwuru na Uche Nwosu tozuru etozu ịzọ Govanọ ma nwekwa nkwado okpuru ọchịchị iri abụọ na anọ n'ime ịrị abụọọ na asaa nke steeti ahụ. O kwukwara na Chineka kwadoro ya. Otu ọkacharamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị sị aga na Naijiria bụ Barr. Collins Okeke kwuru na ọ bụ sọọsọ ndị Imo ga-ekwuli onye ga achị ha. ""Ọ bughị Rochas ga-ekwu onye ga-achị Imo Steeti. Ọ bụ ndị Imo steeti ka ọ dịrị. Ọ bụrụ na ha kpọọ ya ọrụ, ihe Rochas na-ekwu bụ ebunobi ya.""" afirika-43597735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43597735,Mmemme Good Friday: Ndi uka ji ejije na egosiputa ọnwụ Jeso,N'ọtụtụ ụlọuka ha guzobere ihe ejije iji gosiputa ahụhụ Jeso tara tupu akpọgbue ya n'elu obe.,"Ndị ụka Kristi na-echeta ụbọchị akpọgburu Jeso taa Na Blessed Sacrament Parish dị na independence layout Enugu, ndị mmadụ zụkọtara n'igwe kpagharia were ejije ha mụrụ wee gosi ka ndị Jew na Pilate sịrị kpogbue Jeso n'obe. Akụkọ ga-amasị gị Onye na-achịkọba ya bụ ngagharị nke obe ịkpeazụ tupu Easter na parish ahụ bụ Rev. Fr, Ogbozo gwara ndị otu Kristi ka ha nọrọ na nche oge niile ma hụ onwe ha n'anya dịka Jeso sịrị hụ ndị tụkwasara ya obi anya. Ndị uka Kristi n'ụbọchị Good Friday Ka emechara ngagharị nke obe ahụ, eme kwara mmemme isusu obe ọnụ nke na-egosiputa ọgbụgbandụ Jeso na ndị kwere na ya. Gud Fraịde bu nnukwu emume na-eweta Lent n'isi njedebe tupu Jeso ekulie n'ọnwụ n'ụbọchị Easter dika ka ndị otu Kristi sị kwenye. ." afirika-45756035,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45756035,Okorocha: Anyị chọrọ ikpezi okwu pụtara na APC primaries,Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo steeti ekwupụtala ihe na ihe ha na onyeisiala Naijiria kpara na nzuko bụ banyere nsogbu dị na ntuliaka imeụlọ nke steeti ha ga.,"Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Okorocha kwuru na ọ bụ ụzọ a ga-eji mee udo n'ime APC na steeti ndị ahụ dị iche iche bụ ihe ha na-achọ. Buhari na ndị gọvanọ itoolu nke APC nwere nzukọ ụnyaahụ bụ Tọọsde n'Abuja. Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. Na nkọwa o nyere ndị ntaakụkọ e mechara ọgbakọ ahụ, Okorocha kwuru na ndị gọvanọ chọrọ ka e mee ihe ziri ezi site n'usoro iwu pati ahụ bụ nhatanha, ikpe ziri ezi na imezi ihe. Mkparịtaụka ahụ ha nwere ụnyaahụ n'obi ọchịchị onyeisiala dị n'Abuja were ihe dịka awa abụọ na ọkara. Ndị gọvanọ bịara ya gụnyere Abiola Ajimobi nke Oyo, Abdul'aziz Yari nke Zamfara, Ibikunle Amosun nke Ogun. Ndị ọzọ bụ Rotimi Akeredolu nke Ondo, Simon Lalong nke Plateau, Abubakar Sani Bello nke Niger nakwa Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46783000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46783000,Daily Trust: Mwakpo ndịagha mere megide ha ezighi ezi n'ọchịchị ọhakarasị - Eddie Iroh,"Onye bụ bụ ọnyeisi n'ụlọọrụ Radio Naịjirịa, bụ Dọkịnta Eddie Iroh, akatọọla etu ndị agha Naijiria si wakpo ụlọọrụ mgbasaozi Daily Trust.","O kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ Daily Trust emeghị ọfụma site n'iwepụta ozi nzuzo ndịagha ji awakpo ndị iro Naijirịa dịka akụkọ si kwuo, ma mwakpo ndịagha Naịjirịa ezighị ezi n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Iroh gwakwara BBC Igbo n'ekwenti na ọ bụrụ n'obodo ebe a na-eme ihe nkeọma, mwakpo a kwesiri ịbụ ọrụ ndị uweojii makana ndịagha na-eji ike eme ihe ha. O kwukwara na ndị uweojii kwesikwara inweta akwụkwọ ikike site n'ụlọikpe tupu ha emee ihe ọbụla, bụkwa nke a ga-eme n'ụzọ ziri ezi. Na ntụziaka ya, o kwuru na ọbụrụ na ihe ndị Daily Trust depụtara bụ nke e chere na ọ gahiere ụzọ iwu nchekwa obodo Naijiria, ha kwesiri ka ha mee nkọwa gbasara nke a. Cyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ N'aka ọzọ, onye otu ọrụ ntaakụkọ bụ Maxim Ụzọatụ, katọrọ agwaa ndị agha kpara, ma kọwaa ya dịka nke e mere iji tinye egwu n'ime ndị na-arụ ọrụ ntaakụkọ na Naijiria. Ọ gakwara n'ihu dụọ ndị ntaakụkọ ọdụ ka ha hie asaa n'anya, ma nyochaa akụkọ ọbụla ha nwetara iji gbanahụ akparamagwa dị otu a. Ka ọdị, ọnụ na-ekwuru otu agha Naijiria bụ Sani Usman enyela nkọwa, ihe mere ndị otu agha jiri mee mwakpo a megide ụlọọrụ Daily Trust. O kwuru na ụlọọrụ a dara iwu site n'ibipụta akụkọ gbasara atụmatụ ọrụ ndị agha ji n'aka megide ndị otu Boko Haram, bụ nke o kwuru megidere iwu nchekwa obodo Naijiria, Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51325665,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51325665,Brexit: Ihe asaa ga-agbanwe dịka Briten apụọla n'otu EU,Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka United Kingdom esila n'ọgbakọ European Union pụọ n'ikpeazụ mgbe ha nọchara afọ iri anọ na asaa n'ime ya.,"O were United Kingdom ihe karịrị afọ atọ iji mee ntuliaka maka ọpụpụ ha. Kemgbe afọ atọ a, Praịm Mịnịsta abụọ agbaala arụkwaghịm. Mana ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ karịsịa ndị Naịjirịa bụ kedụzie ihe ga-agbanwe ugbua ha pụrụ? Onye nke atọ bụ Boris Johnson bụzi onye ga-edu Briten pụọ na EU bụ nke a kpọrọ 'Brexit' na Bekee. Ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị Fraịde, ụbọchị 31 nke ọnwa Janụwarị afọ 2020, Briten agaghịzi abụ otu n'ime mba ndị nọ n' EU. Lee ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ ga-agbanwe ma nke a mee: 1. Ndị mba Briten nọ n'ụlọomeiwu EU ga-atufu ọkwa ha. Ndị Briten nọ n'ụlọomeiwu EU dị mmadụ 73. 2. Briten agaghịkwa na-eso n'ọgbakọ 'EU Summit' maọbụ n'ọgbakọ EU ndị ọzọ ma ọ bụrụ na enyeghị ha akwụkwọ iji sị ha bịa. 3. Mba UK na mba ndị ọzọ nweziri ike ịkpa nkata maka azụmahịa. Mgbe UK nọ na EU, ha na mba ndị ọzọ enweghị ike ịkpa nkata azụmahịa n'onwe ha. A gbanwere 'passport' nke ochie n'afọ 1988 4. Ụcha akwụkwọ njirimaraonye nke mba UK ga-agbanwe. 'Passport' nke EU na-acha ọbara ọbara, mana nke mba UK na-acha anụnụ anụnụ. Mgbe mbụ e bipụtara akwụkwọ 'passport' nke anụnụ anụnụ bụ n'afọ 1921. 5. E bipụtala ego igwe '50 pence' ihe ruru nde atọ nke a ga-amalite iri n'ụbọchị Fraịde. Ihe e dere n'ahụ ya bụ: ""31 January"" nakwa ""Peace, prosperity and friendship with all nations."" The coins had to be re-made after Brexit was delayed 6. Ngalaba 'Brexit' ga-emechizi ugbua. Ọ bụ Theresa May mepere ngalaba a n'afọ 2016 iji kpaa ka Briten ga-esi pụọ n'otu EU n'udo. 7. Mba Germany ga-akwụsị ịkpọghachi ndị be ha dara iwu na Briten. Nke a pụtara na ọ bụrụ na onye Germany bi na UK arụọ ala wee gbalaa mba Germany, agaghị enwe ike ịkpụlata onye ahụ na UK ka ọ bịa zara ọnụ ya. Iwu mba Germany akwadoghị ịkpọpụ nwaafọ mba ahụ ka e kpee ya ikpe na mba ọzọ. Ndi isi UK gwara BBC na ọ bụrụ na ihe dị otu ahụ emee, ha ga-arịọ ka a kpee onye ahụ dara iwu ikpe na mba ọbụla ọ gbagara. Ihe asaa na-agaghị agbanwe Njem ụgbọelu agaghị agbanwe maka ndị mba UK 1. Ime njem agaghị agbanwe ruo ọnwa Disemba 2020. Njem ụgbọelu, ụgbọmmiri na ụgbọoloko ga-adịkwa ka ha dị na mbụ ruo mgbe a kpachara maka 'Brexit' nke ọma. 2. Akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala agaghị agbanwe maka ndị UK. 3. Akwụkwọ mkpuchi ahụike (Health Insurance Card) agaghị agbanwe. Ha ga-adịgide ire ruo mgbe a kpachara maka 'Brexit' nke ọma. Special cards that let people from Britain get healthcare in the EU will still be valid during the transition 4. Ndị mba Briten bi na obodo EU nakwa ndị EU bi na Briten agaghị enwe nsogbu ọbụla. Ha ga-enwe ikike ibi na mba ọbụla ha chọrọ ma nwekwaa ikike ịrụ ọrụ na mba ebe ha bi. 5. Ndị UK bi na mba EU ga na-anata ụgwọ ezumike nka ha (pensions) dịka ha si emebu na mbụ. 6. Mba UK ga na-atụ ụtụ n'akpa EU ruo mgbe a kpachara 'Brexit' nke ọma. 7. Nzụkọrịta ahịa n'etiti EU na UK ga na-aga n'ihu dịka ọ dị na mbụ." afirika-47242614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47242614,Nigeria Election 2019: Pụtanụ n'igwe tụọ vootu na Feb 23 - Fada Oyoyo,"Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-aga n'ihu ikwu uche ha banyere nyigharị e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị Febrụwarị 16, 2019.","Ụkọchukwu Adolphus Chukwu e ji Fada Oyoyo mara, bụ odeakwụkwọ nke ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Katọlik Diocese nke Ọka, Anambara Steeti, gwara BBC na ọ ma na obi adịghị ọtụtụ ndị Naịjirịa mma maka nyigharị ntuliaka. Kama ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ pụta n'igwe n'ụbọchị ntuliaka, bịa tụọ vootu makana ọ dị mkpa. N'akụkọ yiri ya, Otu ọkaiwu akpọrọ Kayode Ajulo, gwara BBC na gọọmentị etiti kwesịrị ịrịọ ndị Naịjirịa mgbaghara maka oge ha gburu ndị mmadụ na ihe ndị ha mefuru site na nyigharị e yigharịrị ntuliaka. Ajulọ kwukwara na ọ ga-adị mma ka gọọmentị nye ndị Naịjirịa ihe itiaka n'obi dịka inye mmanụ ụgbọala n'efu n'ime ụbọchị abụọ, iji gosi na ha dị na mwute maka ihe merenu. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, akpọkuola mba ndị dị na Yurop gụnyere Briten na Frans, ka ha kpọghachịta ihe karịrị narị asatọ bụ ndị agha nnupuisi ISIS ha jidere na mba Siria, ma malite ikpe ha ikpe. O kwukwara na mgbidi isi ISIS na-achọzị ịda. N'egwuregwu, Sergios Ramos ritere akwụkwọ ọbara ọbara mere ya nke iri abụọ na ise ọ na-enweta dịka onye na-agbara Real Madrid bọọlụ, ka otu Girona ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ha. Nke a mere ka Ramos na-ewu n'elu soshal midia. Ngalaba na-achịkọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC n'aha ịchafụ akọwala na o nweghi onye na-efe ala nna ya nwụrụ na Bawụchi steeti ụnyaahụ dịka adọtịrị ntuliaka. Afolayan James bụ onyeisi NYSC na steeti ahụ kwuru na kepu kepu a nụrụ na mmadụ iri nwụrụ n'isiụlọọrụ ha bụ okpotokpo asị. Dịka a na-agụkọ ihe ndị furu maka ndọtị adọtịrị ntuliaka ụnyaahụ onyeisi ndị na-azụ ahịa na Naịjirịa gwara ndị ntaakụkọ na ihe mba Naịjirịa mefuru ga-eru ijeri naira otu narị na iri anọ. Ken Ukaoha bụ aha nwoke ahụ kwukwara na ndị mmefu a kachasị metụta bụ ndị na-azụ ahịa. Na mba ofesi, Ụgbọelu ndị agha mba Amerịka amalitela ị bụgara ndị mba Venezuela akụrụngwa enyemaka n'otu obere obodo dị nso n'oke ha. Onyeisi ndị nnupuisi na mba ahụ bụ Juan Guaido ahazikwala ihe ruru mmadụ puku narị isii bụ ndị ga-enye aka bubata ngwa enyemaka n'akụkụ Venezuela n'izuụka na abịa. N'egwuregwu, Mba Sawụt Afrịka gbapụrụ otu Flying Eagles nke Naịjirịa n'asọmpị iko mba Afịrka ụnyaahụ Ha ji ọkpụ goolu ise asatara atọ nara ha ọkwa onye nke atọ dịka ha zutere na Niamey n'ụbọchị satọde." afirika-49869000,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49869000,Komla Dumor Award 2019: Onye Uganda amaburula ya bụ nturugo,Onye ntaakụkọ Yuganda bụ Solomon Serwanjja eritela nturugo Komla Dumor 2019 nke BBC hibere.,"Solomon Serwanjja bụ onye nke ise irite nturuugo a. Serwanjja bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ 'NBS TV' ebe o na-eme otu ihe ngosi na-ewu ewu. Waihiga Mwaura ritere BBC World News Komla Dumor award O mepụtala akụkọ dị icheiche nwetere ihe nrite ma nke o mepụtara ngalaba akpọrọ 'BBC Africa eye' gbasara ire ọgwụ gọọmenti wepụtara ka-ejiri gwọ ndị mmadụ na nkịtị. Nturugo a malitere kamgbe afọ 2014, iji wee kwanyere onye ntaakụkọ BBC bụ Komla Dumor nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri anọ na atọ, n'afọ 2014. Serwanjja bụ onye nke ise na-erite ya bụ nturugo dịka Waihiga Mwaura, Amina Yuguda, Didi Akinyelure nakwa onye Yuganda Nancy Kacungira ibe ya ritegoro ya. Dịka a na-amalite nturuugo Komla Dumor nke afọ a, ndị otu ya n'ụlọọrụ na-echeta ọrụ ya Nturugo a gunyere ya ị ga-anọdụ n'isi ụlọrụ BBC dị na mba UK , ma mecha gaa Yuganda gaa mee akụkọ ga-ewu ewu. Serwanja gbara mbọ me ka ndị ọkaikpe na-enyocha ndị na-azọ nturugo a ghọta atụghị ụjọ n'iwepụta akụkọ ọbụla bụ nke ga-enye ọha aka. Onyeisi 'BBC World Service Group' bụ Jamie Angus kwuru na ntụrụgo a bụ nke eji akwanyere Komla ugwu dị BBC ezigbo mkpa. Ihe nkiri a ga-amasị gị Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo? Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42817934,https://www.bbc.com/igbo/42817934,Ndị na-egbu ugbo azụ akwadola ka a machie ịtụbata azụ,Ndị ọkụ-azụ na ndị na-azụ ya n'ala Naijiria akwadola ka a machie ịtụbata azụ.,"Sọọsọ pacent ịrị atọ azụ a na-eri na Naijiria bụ nke e nwetara n'ala anyị Otu onye n'ime ha,bụrụkwa onye nwe Sprout Jet Ltd bụ Chukwudi Adibe gwara BBC sị: ""Ọ ga-eme ka ndị na-egbụ ugbo azụ nwe mbawanye n'ihi na ọ ga-enye ha ohere ire azụ karia ka ọ dị na mbụ,meekwa ka akụ na ụba Naijiria na-aga n'ihu."" N'ụbọchị ịrị abụọ na anọ nke ọnwa Jenuwarị, ndị omeiwu nta kwuru na ha chọrọ ka a machie ịtụbata azụ na nwayọọ nwayọọ, iji mee ka ebido na-enweta azụ nile ana-eri n'ala anyị. Alo nke otu n'ime ha bụ Mr. Tasir Olawale-Raji bulitere, kwuru na oke ịtụbata azụ mere Naijiria ala ebe a na-atụbata ụdị azụ dị iche iche nke gunyere azụ ndị adịghị mma mmadụ iri. Ndị omeiwu ahụ kwuru na o were ha anya na ọ bụ nanị metrik tọn puku iri asatọ ka a na enweta n'ala Naijiria nke bụ pacent iri atọ n'ime nde abụọ, puku nari asaa a chọrọ maka oriri." afirika-43482314,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43482314,Taa ka ụlọọrụ BBC West Afịrịka na-emepe na Lagos,"Ụlọọrụ BBC nke mpaghara ọdịdaanyanwụ Afịrịka na-emepe ụlọọrụ ha dị na Lagos, Naịjirịa nye ụwa niile taa.","Solomon Mugera na-ekele ndị Igbo Nke a na-esote mbido mgabsaozi nke asụsụ abụọ dị na Naịjirịa bụ Igbo na Yoruba nime BBC ụbọchị Febuwarị 19 afọ bụ 2018. E mepecha ụloọrụ a taa, ị mara na Naịjirịa ga-abụ ebe mgbasaozi nke asụsụ anọ sọ na asụsụs BBC ji agbasaozi na mpaghara Afịrịka. Asụsụ ndị ahụ bụ Igbo Yoruba, Hausa na Pidgin. Mmemme a ga-anabata Jamie Angus bụ onyeisi BBC World Service Group nakwa ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara omenaala dị icheiche nke BBC ji agbasaozi. A ga-eji hashtag #BBCWAfricaLaunch wee gbasaozi maka mmemme a n'igwe social media. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53797664,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53797664,Ronald Koeman: Ọ ga-ebulinwu Barcelona elu ọzọ?,Ronald Bignan Koeman na-achịkọta otu egwuregwu mba Nedalandị anọchiela Quique Setien dịka onye nchịkọta Barcelona.,"Cheta na a chụrụ Setien dịka otu Bayern Munich ji ọkpụ goolu asatọ asatara naanị abụọ gbaara Barcelona ụgbọ nwamkpi n'abali ole na ole gara aga n'asọmpi Champions League nke afọ 2020. Josep Bartomeu bụ onyeisi otu egwuregwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya, na Koeman ga-anọ n'ọkwa onye nchịkọta ahụ ruo afọ 2021. End of Twitter post, 1 Ị chọrọ ịma onye Koeman a bụ? Lee ihe anyị chọpụtara maka ya: Ị hụla na o nyerela ndị ọ gbaara bọọlụ aka ibute iko mgbe ọ chịkọtara ha, ọ dị gị ka ọ ga-eme ọfụma na Barcelona ma ọ bụrụ na ọ gaa ịchị ha?" afirika-48559490,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48559490,Rochas Okorocha: Ụlọikpe enyela Inec iwu ka ha nye Okorocha asambodo mmeri ya.,"Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ asaala okwu gbasara iwu ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja nyere ha ka ha nye Rochas Okorocha, aka chịburu Imo steeti asambodo mmeri ya dịka sinetọ.","Na mkpebi nke Jọstis Abang Okon nyere ụbọchị Fraide, o kwuru na Inec enweghị ikike ijichi asambodo mmeri Okorocha dịka a kpọrọla ya onye meriri na ntuliaka e mere n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2019 maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-West n'Ụlọomeiwu Ukwu. Ma na mgbarịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na Inec ga-ebu ụzọ lebanye anya n'okwu ahụ. Dịka Okoye siri kọwaa, ụlọikpe abụọ; ụlọikpe ukwu n'Abuja nyere ha iwu, ebe ụlọikpe ukwu ọzọ dị n'Owere nyeburu ha iwu ka ha hapụ inye onye ọbụla na ndị zọrọ ọkwa ahụ asambodo ganye na ha ekpebie ikpe ahụ nke ga-abịa ọzọ n'ụbọchị Juun 26. Okoye gara n'iru kwuo sị ""Ụlọọrụ anyị na-eme ọgbakọ ilebanye ka e si mee ntuliaka na steeti dị icheiche nke ndị kọmishọna anyị na steeti ga na-esonye. ""Ọ bụ emecha ya ka anha ga-anọkọọ lebanye anya n'okwu ahụ."" Cheta Inec jụburu inye Okorocha asambodo mmeri na ntuliaka Ụlọomeiwu Ukwu e mere. Rochas Okorocha N'okwu ya na ịnabata mkpebi ahụ, Okorocha gosiri obi ụtọ ya were kwuo na mmeri ahụ bụ mmeri nye ọchịchị onyekwuoucheya. Okorocha onye kwuru nke site n'ọnụ onye na-ekwuru ya bụ FCC Jones Onwuasoanya, boro ""ndị iro ọchịchị onyekwuoucheya n'ime APC na ndị anọghị na APC"" ebubo ịkpa nkata ọjọọ butere ya ihe ọ gabigara."" Ibeawuchi Akụkọ ka na-abịa." afirika-56377017,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56377017,Ụdịrị ọchichị e nwere na Naịjirịa kpatara na ezi nchekwa adịghị - Charly Boy,Charles okputa ejikwanụ charly Boy maọbụ Area Fada mara ataala ụkwa ja eze site na mkaparita ụka onwere na etiti ụlo ọrụ BBC Igbo n'ụbọchị nke 15 nke ọnwa Maachị bụ Monde.,"Na-ịza azịza banyere enweghi nchekwa na mpaghara Naịjirịa dị iche iche, Charly boy katọrọ ọchịchị nọ ugbua n'ebe ọdị ukwuu. Ọ hụtara ya dika ọchịchị nchigbu. Ọ sị na ọ dika ọchịchị ngwere na achị. Okwenyere na ihe na-eme egbua n'ala Naịjirịa mekwara mgbe gboo gbanye na nke ugbua ka njọ. Ọ sị na ọ bụ na ndị fọnfọnju akpa juru n'oche. Kirie etu okwu ya siri kwụrụ n'ebe a: N'itinye ọnụ n'okwu a banyere enwepụta Asari Dọkubọ dịka onyeisioche ọgbakọ ọhụrụ a kpọrọ ""De Facto Biafra Customary Government"", Charly Boy kwuru na okwu ahụ bụ akụkọ idunọba. Gbanye na ọtụtụ ihe na-eme n'ala Naịjirịa bụ nke eji egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị. N'okwu metutara IPOB na otu nchekwa mpagara southeast a kpọrọ ""Eastern Security Network"" (ESN), Charly Boy kwuru na onye ụlọ ya na agba ọkụ anaghị achụ oke. Ọ sịkwa na ebe ndị Ọdịda Anyanwụ nwere otu a kpọrọ Amotekun, ndị Ugwu e nwee nke ha . Ọ sị na ọ bụghị ihe ọjọ ndị Ọwụwa Anyanwụ inwe otu nchekwa ESN. Ojikwara ohere a dụọ ndị ntoroọbia ọdụ . Ihe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa" media-43652862,https://www.bbc.com/igbo/media-43652862,Udo ka na-akọ na Kogi steeti,Ugbua abụghị oge kachasị mma n'ihe gbasara udo na Kogi steeti maka ọtụtụ mmadụ ndị jiri egbe na-egbu na steeti ahụ.,"Ndị uweojii na-ekwe nkwa na ihe a anaghị eme ọzọ na Kogi Ụnyahụ ndị jii egbe gburu ndị uweojii abụọ n'ụlọọrụ ha n'obodo Gegu na Kogi steeti. Mkpamkpa a na-eso ihe mere n'ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ime ọnwa Maachị hụrụ mmadụ isi gbanahụchara ndị uweojii na steeti ahụ. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchiri ndị uweoji na Kano steetị bụ Abubakar Aminn Sadiq n'elu ekwentị, o kwuru na ihe a na-eme na Kogi steeti anaghị enwe ike ime na Kano maka nkwadebe ndị uweojii mere na steeti ahụ. O kwuru na ""ụlọọrụ anyị na Kano steeti nwere ihe osise n'ebe niile na-ahụ mmadụ ọbụla na-abata ma pụọ n'ụlọọrụ anyị."" O kwukwara na ndị otu ya dị njikere n'ọrụ ya. Egwu ka dị n'obi ndị biri n'obodo di icheiche na Kogi maka ndị jii egbe n'egbu ndị mmadụ Mpu na aghụghọ Mana otu onye okachamara na n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ Emeka Monye kwuru ihe ole na ole mmere ihe a n'eme na Kogi steeti. Na nke mbụ, o kwuru na ọtụtụ n'ime ndị uweojii a na ndị a nupu isi n'iwu na-ejikọ aka n'aka. Na ndị uweojii na-ana ha aka azụ O kwukwara na ndọrọndọrọ ọchịchị na Kogi steeti so kwa na ndị na-ebute nsogbu n'obodo a. Na nsogbu dị n'etiti gọvanọ steetị ahụ bụ Yahaya Bello na Sịnetọ Dino Milaye so na ihe na-ebute nsogbu na steetị ahụ. N'ọnụ okwu ya: ""ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla mara ihe a kwesiri ime maka ị che onwe ha. Ihe na eme na Kogi bu ihe ama ama eme. Ọ dị njọ makana ọ bụ ndị nkịtị ga-ata ahụhụ dị na ya"" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-57134251,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57134251,Ayamelum LGA: Gịnị na-eme n'etiti ndị Anakụ na Omoku dị n'Anambra steeti?,"Ozu mmadụ atọ ka ndị uweojii Anambra steeti hụrụ ka ọ dị ugbua, dịka Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ha si kwuo.","Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị obodo Anaku na Omor dị n'okpuruọchịchị Ayamelum banyere ọgụ na mgba nke butekwara ịgba ọtụtụ ụlọ ọkụ. Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụ esemokwu gbasara ndọrọndọrọ ala butere ọgbaghara a mere n'ụtụtụ Sọnde, Mee 16, 2021. Ikenga gwaburu BBC Igbo na kọmịshọna uweojii Anambra steeti bụ Monday Bala Kuryas, gara ebe ihe mere. ịga jiri anya ya lee etu ihe si kwụrụ, ka o dupuchara ndị nke ya ebe ahụ. O kwuru na ka ọ dị ugbua, ihe niile ederela duu n'etiti ndị Anaku na ndị Omor ebe ọ ka na-eche ka ndị otu ya nyekwuo ya ozi gbasara ya bụ ọdachị. Ndị omekome achụfusiri ndị bi n'ogbe Ifite Isuaniocha community, dị n'okpuruọchịchị Awka North nke Anambra steeti? Akụkọ ọzọ pụtara na ndị bi n'ogbe Ifite Isuaniochariri mbo mbo ọsọ makana ha hụrụ na soshal midia na ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ndị ha na-eche bụ ndị ọchị ehi gbabatara n'uju. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na nke ahụ bụ ezigbote asị mabụrụ kepu kepu na-achịtaghị aja maọlị. Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ" afirika-53734616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53734616,Abia State: Ụkọ bread emeela anyị ịwa n'Aba,"Dịka achịcha Bekee 'bread' kọrọ ụkọ n'Abia steeti abalị olemole gara aga, ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ akọọla etu ha na ihe si eme.","Ndị ụlọọrụ na-emepụta bureedi arụbeghị ọrụ ụbọchị olemole nke mere na ndị mmadụ ahụghị nke ha ga-azụ. Chima Akudike, onye bi n'Aba gwara BBC Igbo na ya bụ ihe adịghịrị ọtụtụ ndị mmadụ mfe. O kwuru sị: ""Ọtụtụ ndị mmadụ bụ bureedi na mmanya ọtọ bịrịbịrị ka ha ji eme nri ụtụtụ."" ""Tulegodi ihe ndị dị otu a ga-emezi ugbu a."" Bread so na nri ndị mmadụ kacha eri na Naịjirịa Dịka Akudike si kwuo, ụlọahịa niile dị n'okirikiri ebeo bi enwebeghị bureedi ruo n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde. Ọ kọwara na ọ bụ abụbụ ọrụ ka ụlọọrụ na-emepụta bureedi gbara n'ihi na ha kwuru na ọnụahịa ntụ e ji eme achịchị nke bekee kpọrọ 'flour' arịala elu nke ukwu. Mana onye ọzọ bi n'Aba gwara BBC Igbo na ndị bureedi amalitela ire obere obere n'okirikiri nke ya. Gịnị kpatara bureedi jị kọ n'Abịa Ndị na-ere achịcha na-enwetakarị ezigbo ego na ya Otu jikọtara ndị na-eme bụredị n'Abịa steeti bụ otu a kpọrọ 'Master Bakers' na Bekee. Onyeisi ha bụ Emma Nwaohia gwara ndị ntaakụkọ na ha chọrọ ịme nzacha ma mkpocha iji kwadoo ịmalite ọrụ n'uju kemgbe akpọghechara obodo ọzọ maka ọrịa coronavirus. Nwaohia kwuru na ọ bụ ya kpatara ha ji wụsaa ọwa kemgbe otu izuụka gara aga. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị otu 'Master Bakers' ga-eji ohere ahụ tịnye anya n'ihe ụfọdụ na-akpa ha. Nwaohia kwuru na agha coronavirus a mekpara ha ahụ nke ukwuu nke mere ọnụahịa ihe niile ha ji eme bụredị ji rịchaa elu ọjị. O kwuru na kemgbe Maachi, na ihe niile e ji eme bụredị dịka flọọ, shụga, bụta na ndị ọzọ arịala elu ugboro ise karịa. BBC Igbo na-agba mbọ inweta Nwaohia ka ọ kọwaara anyị ihe na-emenụ n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49506622,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49506622,Ebonyi market closure: Ihe mere e ji mechie ahia Abakpa dị n'Abakiliki,"Ahịa Abakpa nke dị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti mechiri nwa mgbe nta ụnyaahụ n'ihi ọgbaaghara.","Ahịa Ọgbaaghara a bidoro mgbe ndị ọrụ gọọmentị na-anakọ ụtụisi gara ịrụ ọrụ ha. Akụkọ kwuru na ọgụ suru n'etiti otu onye na-ere ahịa na otu onye ọnakọ ụtụ nke mere ka e gbuo onye na-ere ahịa. Nke ahụ kpataziri nnukwu nsogbu mere ka ndị uweojii bịa gbalie egbe elu ma gbakwaa anwụrụ anya mmiri. Mana dịka Emmanuel Uzo - bụ ọnụ na-ekwuru aka na-achi Ebonyị steeti, David Umahi - si gwa BBC Igbo, onweghi onye ọbụla nwụrụ na ọgbaaghara ahụ. O kwuru na ọtụtụ ndị bi n'Ebonyi steeti anaghị achọ ịkwụ ụgwọ ụtụisi ha na agbanyeghi na ha na-ahụ ihe gọọmentị ji ego ahụ arụpụta. Ọ kọwakwara na ọ bụ naanị ụnyaahụ ka e mechiri ahịa Abakpa, ma kwukwaa na ahịa ahụ na-azụ ugbua. Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu Uzo gakwara n'ihu kwuo na e nwere ụzọ ndị ọzọ dị mfe gọọmentị wepụtara ka ndị mmadụ wee kwụọ ụgwọ ụtụisi. Ha gụnyere ịga n'ụlọọrụ ndị nnakọ ego a kpọrọ ""Board of Internal Revenue"" na bekee, maọbụ ịga n'ụlọakụ ọbụla dị onye nso. ""Ọ bụrụ na ọhịaa mmadụ ahụ ịga ebe ndị a, gọọmentị ga-enyere onye ahụ aka site na iziga ndị ga-aga n'ụlọ ahịa ya iji nata ya ụtụisi ya."" Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a. Mbọ BBC gbara ịjụta ndị uweojii etu ihe si kwụrụ ugbua, amịtaghị mkpụrụ. Loveth Odah, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi, azaghị oku anyị kporo ya n'ekwentị. Ọ zaghachikwaghị ozi ""SMS"" anyị zigaara ya. Onweghị onye na-achọ ọrụ Peter Obi - Dave Umahi Uzo kwukwara na gọọmentị arụọla ahịa ọhụrụ bụ ọkacha mma, ebe a chọrọ ka ndị mmadụ kwafee. Mana ndị ahịa ekweghi ịkwafe n'ahịa ọhụrụ ahụ. Okwu ahụ ka dị n'ụlọikpe ugbua. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 'Ndị bi n' ikpere mmiri ọkachasị ndị bịdebere Osimiri Naija gbabanụ ọsọ ndụ' Ipob na-erugharị na Japan na-achọ Buhari Gbawa ka ụkwụ gị ha ma ị hụ akparamagwa ndị a n'onye chọrọ ịlụ gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Dora Akunyili: Aka m na-ahụ nwunye m na nrọ" 42835296,https://www.bbc.com/igbo/42835296,Otu pati akpọla oku maka nchịgharị gọọmenti Naịjirịa,Otu kọmiti na-etinye anya na ihe gbasara nhazi ọchịchị na Naịjirịa nke ndị otu APC akpọla oku ka ahazigharịa ọchịchị na Naịjirịa.,"nchịgharị gọọmenti bụ okwu na-akpotụ akpọtụ na Naijiria ugbua Kọmiti ahụ nke Gọvanọ na-achị Kaduna Steeti bụ onye isi ya kwuru ka achịgharịa ihe ruru mkpụrụ iri dị n'akwụkwọ iwu. Mana onyeisi otu pati APC n'Enugwu bụ Ben Nwoye kwuru na otu kachasị elu n'ime pati ahụ emebeghi nzụkọ ga-anabata akwụkwọ ahụ kọmiti ahụ dere. O kwuru na otu pati ahụ akaghị nabasịa ya bụ akwụkwọ rue mgbe ha mere nzụkọ di elu ebe ndị niile ọgbasara ga agbakọ tinye anya n'akwụkwọ ahụ. Ihe iri kọmiti ahụ kwuru 1. Njikwa akụ na ụba - Kọmiti ahụ dere ka akụ na ụba Naịjirịa dịka mmanụ agbidi ga na steeti. K e mezie iwu gbasara mmanụ ka o gosi na steeti nwere ike inye ndị mmadụ ikike igwupụta mmanụ. 2. Ịzọ ndọrọndọọ n'onwe - Kọmiti ahụ kwukwara ka e nwe ohere maka ndị chọrọ ịzọ ọchịchị n'onwe ha na abenyeghi otu pati ọbụla mana ka ndị dị otu a ghara inwe akwụkwọ maọbụ kaadị otu pati ọbụla rue ọnwa isii tupu ntuliaka onye ahụ chọrọ ịzọ. 3. Ikewapụta steeti na mkpokọ - Kọmiti ahụ ekwetaghị na ikewapụta steeti ọhụrụ dịka ha kwuru na nke a agaghị amịta mkpụrụ bara uru. 4. Nwere onwe ndị gọọmenti okpuru ọchịchị - Kọmiti ahụ kwuru ka ahapụ ka steeti na-elekọta ndị okpuru ọchịchị nọ na steeti ha. 5. Ndị Uwe Ojii na ndị nchekwa ụlọ mkpọrọ - H kwuru ka ewpụ ndị uwe ojii n'okpuru gọọmentu etiti tinye ya na steeti ebe a ga-enye ndị uwe ojii steeti ohere gbasara ụfọdụ okwu. 6. Ụbọchị ezumike - Ha kwuru ka ewepu okwu gbasara inye ụbọchị ezumike n'okpuru gọọmentị etiti tinye ya ka gọọmenti etiti na steeti nwe ike inye ụbọchị ezumike nke steeti maọbụ nke gọọmenti etiti. 7. Stampụ - Ndị kọmiti ahụ na-ekwu ka steeti na-enye stampụ gbasara ndị na-azụ ahịa. 8. Nwa ọdịnaala - Ha kwuru ka ewepụ ebe a na-ede okpuru ọchịchị ebe isi oge a na-edenye aha n'akwụkwọ tinye steeti ebe i bị. Ebe a, ha kwuru ka enye onye birila otu ebe ọtụtụ ohere ịzọ ọchịchị ebe ahụ obirila. 9. Ndị ọkaikpe - Ha kwuru ka ekewapụta otu ndị ọka ikpe nke steeti ndị ga-ahọpụta ndị nnọchi anya ha ma dọọkwa onye ọkaikpe ọbụla mehiere aka na ntị. 10. Referandum - Ha kwuru ka emezie akwụkwọ iwu ka o nye ohere maka referandum ma ọ bụrụ na o nwe okwu dị oke mkpa dapụtara tupu ekpebie ya. Oge ọ natara ya bụ akwụkwọ, onyeisi pati APC bụ Adigie Oyegun kwuru n'ọnwa Febuwarị, ndị otu pati niile ga-agbakọ lemie anya n'akwụkwọ ahụ. N'aka nke ọzọ, ndị otu pati PDP kwuru na ha na-eleba anya n'akwụkwọ ahụ tupu ha ekwuo ebe otu ha kwụ na ya bụ akwụkwọ." afirika-50626320,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50626320,Ikoyi Prison: Ọkụ latrik adọgbuola mmadụ ise n'ụlọmkpọrọ,Ọkụ latrik adọgbuola mmadụ atọ na-ezuike n'ụlọmkpọrọ Ikoyi nke dị na Legọs.,"Otu onye na-arụ ọrụ ebe ahụ achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọdachi a mere n'ezie. O kwuru na ọ bụ mgbe eweghachitara ọkụ ka eriri bu ọkụ latrịk dobiri metụ akwa igwe ebe ndị ahụ dina ezuike. O kwukwara na ọ bụrụ na ihe mere n'abalị ọ kara ịka njọ n'ihi na ụfọdụ n'ime ha agaala ụlọikpe mgbe mkpamkpa a kpara. Atụọla onye uweojii na Saut Afrịka nga afọ iri atọ maka igbagbu nwaafọ Naịjirịa Onyeuweojii ga-erite nga afọ iri ato na Saut Afrịka maka igbagbụ nwaafọ Naijirịa. Ụlọ mgbasa ozi dị na Naịjirịa ekwuola na ụlọikpe dị na Saụt Afrịka atụọla onye uweojii aha ya bụ Austin Reynold nga afọ iri atọ maka igbagbụ nwaafọ Naijiria bụ Ebuka Okoli n'anya ọcha. Ụlọ mgbasa ozi a na-akọwa na-eboro Reynold onye gbara afọ iri abụọ na anọ ebubo ịgbagbu Okoli ma zuo ya ohi n'obodo Durban nke dị na Kwa Zulu-Natal Saut Afrịka. Ọ bụ onye uweojii ibe ya bụ Brinley Pallo gbara ama megide ya mgbe ọkaiwu bụ Shyam Gyanda na-ekpe ya bụ ikpe. Ụlọikpe tụrụ ya nga afo iri atọ n'ụbọchi Mọnde mgbe ikpe igbu ọchụ mara Reynold n'abalị atọ gara aga (Frịde). Ndị omekome na Saut Afrịka Harry Knoesen na ndi otu ya na-akpa nkata iwakpo ụlo azụmahịa na-ebe obibi ndị ojii bị na Saut Afrịka N'akụko ọzọkwa ndị uweojii Saut Afrịka anwụchiela mmadụ atọ bụ ndị otu na-akpa nkata iwakpo ndị mmadụ na Saut Afrịka. A hụrụ egbe na ogbunigwe n'aka ndị otu a bụ National Christian Resistance Movement na-ama ọkwa nata ike ha sị a napụrụ ndị ọcha. Onyeisi ndị otu a bụ Harry Knoesen na-ama ọkwa ka ndi ọcha bị na Saut Afrịka bịdo ibuso agha iji zọo ndụ ha. Ọ sị na ọ bụ Chukwu gwara ya ka ọ naghachi ike ekwnsu ji ndọrọndọrọ ọchịchị napụ ndị ọcha. Knoesen bụ onye ndụ nke Kraịst lara ezumike nka. N'Akụkọ ọzọ Lionel Messi, Virgil van Dijk and Cristiano Ronaldo Taa ka a ga-amata onye ga-eturu ugo Ballon D'or bụ nke a na-enye onye kacha mara agba bọọlụ n'ụwa. Ka ọ dị ugbua, o doro anya na ọbụ Lionel Messi, Virgil Van Dijk maọbụ Cristiano Ronaldo ga-eturu ugo a. Cheta na ọbụ Messi tuuru ugo ọkacha agba nke ndị Fifa n'ọnwa Sepụtemba. Ebe Van Dijk tuuru ugo nke UEFA n'ọnwa Ọgọst. Messi na Van Dijk eritela ntuurugo otu otu n'afọ a. Messi na-agbara otu bọọlụ Barcelona nke dị na mba Spen, Van Dijk na-agbara ndị Liverpool nke mba Ịngland, ebe Ronaldo nọ Juventus nke mba Ịtali. Luka Modric, onye na-agbara Real Madrid nke Spen bụ onye tuuru ugo a n'afọ gara aga. Mana aha ya adịghị na ndị ga-eso zọọ nke afọ a. Ikpeazu enyela ndịisioche okpuru ọchịchị ọsọ Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu achụọla ndị isioche okpuruọchịchị iri na asaa nke steeti ahụ na ndị osote ha, họpụta ndị ọhụrụ. Dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi steeti ahụ bụ Onyebuchi Ememanka siri dee na akwụkwọ, ndị ohụrụ a esobuola n'ọchịchị di iche iche na steeti ahụ kamgbe 1999. Ememanka kwuru na aha ndị ahụ eruola ndi omeiwu steeti ahụ aka maka nnyocha na ibinyeaka. Ndị isioche ọhụrụ a bụ ndị a: Victor Ubani (Aba North) Cherechi Wogu (Aba South) Maurice Okoro (Arochukwu) Hagler Okorie (Bende) Udo Nwogwugwu (Isiala Ngwa North) Chief Nkem Onwubiko (Isiala Ngwa South). Stanley Ojigbo (Ikwuano) Osita Igbe (Isuikwuato) Kingsley Nnaji (Obingwa) Fred Idika (Ohafia) Ikechukwu Nwabeke (Osisioma) Chief Lucky Akabuike (Umuahia North) Ndukwe Adindu (Umuahia South) nakwa Matthew Ibe (Umunneochi). Abia State emegheela ụzọ maka ndị chọrọ ịchụ nta ego Ọdọụgbọelu Enugwu A na-atụ anya na nruzi ọdọugboelu Enugwu ga-akụrụ ọnụ na Easter afọ 2020 Ọrụ na-aga n'ihu nwayọ nwayọ n'okporoụzọ ụgbọelu si ada n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Cheta na Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru na a ga-arụcharịrị ọrụ n'ọdọụgbọelu ahụ tupu a gbaa Easter afọ 2020. Lee ka ọrụ si aga: Ọrụ na-aga n'ihu Ganduje eburula bata ọzọ Ebe ndị ọzọ na-ahụ ọghọm na mmekọ ndị Fulani na-achị ehị, Gọvanọ Ganduje na-ahụ ụrụ Gọvanọ Kano steeti bụ Umar Ganduje ezigala akwụkwọ ọzọ n'ụlọ omeiwu maka ikewapụta alaeze ọhụrụ anọ na steeti ahụ. Aha alaeze anọ ọhụrụ a bụ Rano, Gaya, Bichi na Karaye. N'ọnwa Mee afọ a ka Ganduje bu ụzọ kewaa alaeze Kano. Ụfọdụ kwuru na nke a bụ iji megbute Lamido Sanusi onye bụ Emir nke Kano. Mana Ganduje kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu. Ụlọikpe mechara kagbuo alaeze anọ ahụ ma kwuo na okike ha adabaghị etu iwu si kwuo. Anyị ga-achụ ndị mbịarambịara si azụ owere bata Onyeisi 'Nigeria Immigration Service' Mohammed Babandede Gọọmentị Naiịjirịa enyela iwu ka ndị mbịarambịara niile si azụ owere bata obodo a gaa debanye aha n'akwụkwọ ndi immigration tupu ọnwa Janụwari afọ 2020 eruo abalị iri na abụọ. Emeghi otu a, onye mbịarambịara ọbụla e nwudere na-enweghị akwụkwọ zuru oke, a ga-achụla ya obodo ya ma machie ya ịbata Naịjirịa ọzọ. Donald Trump na ndị omeiwu US Ndị omeiwu kpọrọ Trump ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo a na-ebo ya. N'ofesi, onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump sị na ya agaghị aga ịza oku ndị omeiwu kpọrọ ya. Ndịomeiwu ahụ ka na-acha Trump ọkụ n'ike n'ihi ebubo agwa na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ekperima akpaala arụ na Bokịna Faso Ihe obi mgbawa mere na mba Burkina Faso mgbe ndị omekome wakporo otu ụlọụka n'obodo Hantoukoura ma gbagbuo mmadụ iri na anọ. Amabeghị ndị kpara arụ nke a mana a na-arọ anya na o nwere ike ịbụ ndị otu oyi egwu a kpọrọ Jihadists mere ya. Iheanacho ka anyi ga-eso Kelechi Iheanachọ zọpụtara ndị otu egwu bọọlụ Leicester City na mgbede Sọnde mgbe o nyere goolu ikpeazu ha ji merie ndị Everton. Nke a bụ asọmpi 'English Premier League' nke mbụ Iheanachọ na-esonye na ya kamgbe a malitere afọ EPL ọhụrụ n'ọnwa Ọgọst. Goolu Iheanachọ mere ka Leicester kwụsie ike dịka ndị nke abụọ na tebulu EPL. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-57005549,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57005549,Rivers State Police Attacks: Ndị ojiegbe gburu ndị uweojii asaa na mwakpo ha mere na Rivers State,Ndị uweojii asaa tufuru ndụ ha na mwakpo ndị ojiegbe mere na Rivers Steeti n'abalị Fraịde.,"Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rịvas Steeti bụ Nnamdị Omoni kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ehihie Satọdee. Maazị Omoni kwukwara na ndị ekperima ahụ napụrụ ndị uweojii egbe AK47 ise na mwakpo ahụ, mana mmadụ abụọ n'ime ha ka ndị uweojii gbagburu. Ebe mgbọ tụrụ n'ụgbọala dị n'ogige ndị uweojii dịka ndị ekperima wakporo ha. Ụlọọrụ ndị uweojii ndị ekperima ahụ wakporo gụnyere: Ụgbọala dị n'ogige ndị uweojii nke ndị ekperima ahụ mebiri Onye ntaakụkọ BBC gakwara gakwara n'Elimbu ebe ndị ji egbe wakpokwara ụlọ ndị uweojii. Dịka o siri kọwa, ndị ji egbe a banyere n'ebe ahụ dịka ọ na-akụ elekere asatọ nke abalị ma gba onye uweojii ha hụrụ ekweghị igosi ha ebe a na-edebe egbe egbe. O kwuru na onyeisi ndị uweojii n'ebe ahụ gwara ya na otu onye otu ha nwụrụ na mwakpo ahụ. Ụgbọala ndị uweojii a gbara ọkụ na mwakpo ndị ahụ Onye ntakụkọ anyị chọpụtara na otu n'ime ndị uweojii ahụ e gburu na Elimgbu bụ onye Ogoja dị na Cross River. Onye uweojii a bi na Rumuchika nke dị na Elioparanwo na Port Harcout, ebe mkpu akwa na-ada n'ihi ọnwụ ya. Onyeisi ndị ntorobịa na mpaghara Elimgbu, bụ Morgan Uche gwara BBC na ụmụ okorobia bi na mpaghara ahụ ekpebiela na ha ga-etinyere ndị uweojii aka n'ichekwa ogbe ha. Uche kwuru na onwebuola oge ha chụrụ ndị ekperima bịara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii ebe ahụ ọsọ, mana nke a mere ha na mberede n'ihi na o mere n'oge abalị. Cheta na Gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike tinyere mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile malite n'elekere iri nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ iji belata ọnọdụ enweghị nchekwa. Ndị ekperima wakpokwara ndị uweojii n'Akwaibom Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu Na nke dịka ibe ya, ndị ekperima wakpokwara ogige ndị uweojii n'Akwa Ibo steeti ma gbuo ụfọdụ n'ime ha. Ya bụ ihe mere n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde a na ụlọọrụ a kpọrọ 'Ini Divisional Police Headquarters', nke dị n'okpuru ọchịchị Ini na steeti ahụ. Otu onye nọ na gọọmentị steeti Akwa Ibom gwara ndị ntaakụkọ Premium Times na ndị ekperima ahụ gbara akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ . Onye ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ndị ekperima ahụ wakporo ndị uweojii ahụ ebe ha na-arahụ ụra ma gbagbuchaa ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Akwa Ibom bụ Odiko MacDon gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ mwakpo mere eme n'eziokwu mana o kweghị ekwu ndị uweojii ole nwụrụ na ya. MacDon kwuru na mmadụ isii nwụrụ na mwakpo ahụ mana ọ bụghị ha niile bụ ndị uweojii. O kwuru na nwunye otu n'ime ndị uweojii ahụ so na ndị e gburu." afirika-43579990,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43579990,Njem Buharị na Legọs: Ndị njem ụgbọelu tọrọ atọ na Legọs,Ọtụtụ ndị njem ụgbọelu ji ụkwụ gaa ibanye ụgbọelụ n'ụzụ ụtụtụ taa dịka e mechiri okporoụzọ na-aga ọdọụgbọelu nke ụlọ na nke mba ofesi na Legọs n'ụtụtụ taa.,"Emechiri ụgbọala ịgba n'okporoụzọ ụfọdụ maka ọbịbịa onyeisiala Muhammadu Buhari na Lagos steeti A na-ele anya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abịa isi obodo Legọs maka mmepe ọdọụgbọala, ga-erute n'ọdọụgbọelu ahụ n'elekere nke iri na otu nke ụtụtụ a. N'ihi mkpọchi akpochiri ọtụtụ ụzọ, ndị mmadụ ji kwu ga ihe karịrị nkeji iri atọ maọbụ otu elekere tupu ha eruo ebe ndị na-abanye ụgbọelụ na-anọ. Mmechị a nke bidoro ụnyaahụ, dịka ndị njem siri kwuo, mekwara na ndị sị mba ọzọ febata n'ọdọụgboelu Legọs na-eji ụkwụ ga ogologo ije tupu ha erute ebe ha ga-abanye ụgbọ ga-akwọga ha ebe ha na-aga. Ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi iwe ha na mkpọchị akpọchiri ezi na ụzọ na Lagos maka ọbịbia onyeisiala n'elu igwe okwu, Twitter. Henry Okelue kwuru: ""Aghọtaghị m ihe mere e jiri mechie Legos maka njem onyeisiala. O bi n'Abuja na-agagharị n'etiti anyị kwa oge ma onwebeghị oge emechiri ya ọbụladị otu ụbọchị."" Inibehie Effiong kwuru : ""E mechie Legos maka njem Buhari. Ndị amala enweghị ike ịgagharị. Egbosara njem ụgbọelụ. E kweghị ka ụgbọala ga n'okporo ụzọ banyere ọdọ ụgbọelu. E mechiri ọrụ ndọ ọrụ boyibo. Ma gị asị na isi dị ndị ndu anyị mma?"" A na-ekwukwa na steeti Legọs ga-efu ihe ruru ijeri naịra 200 maka mmechi emechiri ahịa na ebe ndị ọzọ maka njem onyeisiala na-eme. Onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị abụọ na Legọs dịka ọ ga-emepe ọdọụgbọala a rụrụ ọhụụ na Legọs. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51087850,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51087850,Biafra at 50: Etu Uli/Amọka 'Airstrip' siri zọọ ndị Biafra,"Onye ọbụla ma maka agha Biafra ma maka okporoụzọ ụgbọelu si efedata ma fepu a kpọrọ ""Uli Airstrip"".","Okporoụzọ a toro ogo site Amọka ruo Uli. Ọ bụ ebe a ka ụgbọelu na-ebute nri na ihe ndị ọzọ eji enyere ndị Biafra aka n'oge agha si abata. N'ehihe, a na-eji igu na akwụkwọ ndụ ndi ọzọ mechie ya ka ndị Naịjirịa ghara ịhụ ya. N'abalị, eji ọkụ gosi ebe ọ dị maka ụgbọelu ga-efedata. Oge ahụ, ndị agha Naịjirịa emechiela ụzọ ihe si oshimiri abata. Ọ bụkwa okporoụzọ ụgbọelu a ka onyeisi Biafra bụ Odumegwu Chukwuemeka Ojukwu siri gbaa ọsọndụ ka agha bịara na njedede. Akụkọ ga-amasị gị" 44027327,https://www.bbc.com/igbo/44027327,Ntuliaka imeụlọ APC: Gịnị ga-eme ugbua?,"Otu pati APC mere ntuliaka nke ime ụlọ na wọdụ ha niile dị na ala Naijiria, dịka ha mere nhọpụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti Ekiti na aha otu ahụ.","Ọgbaghara so ntuliaka ime ụlọ ndị APC mere n'akụkụ Naijiria dị icheiche Ogbaghara pụtara nke tara isi mmadụ abụọ na Legos na Delta steeti,ebe emerụrụ ọtụtụ ahụ na Oyo steeti ebe e higharịrị ntuliaka ahụ. Ọ bụ tigbu-zọgbuo and ihe ike so ntuliaka ahụ mere ka Gọvanọ Nassarawa steeeti, Tanko Al-Makura, onye bụ onye ndu kọmitii ntuliaka nke Ekiti jiri kagbuo ntuliaka ahụ. Nsogbu dabutara na Ekiti,Kano,Imo.Rivas na steeti ndị ọzọ. Lee steeti ndị nwere agba gbaghapụrụ ntuliaka ime ụlọ ndị APC: 1. Na Kano, Kwankwanso,Abubakar esonyeghị Rabiu Kwankwanso bụbụ Gọvanọ kano Steeti esonyeghị na ntuliaka ime ụlọ nke APC mere na steeti ahụ Onye chịbụrụ ọkwa Gọvano bụ Rabiu Kwakwanso na Sinetọ na-anọchite anya Kano Centralụ bụ Hafiz Abubakar emeghị ntuliaka ahụ. Onye orụ mgbasaozi Kwakwanso bụ Binta Sipkin gwara ụlọ akụkọ Premium Times, na ndị otu APC kwụnyere Kwakwanso mere ntuliaka nke ha na wọdụ 484 dị na steeti ahụ. Mana ọnụ na ekwuru Gọvanọ stteeti ahụ bụ Abbar Awnwar wuru na Gọvanọ steeti ahụ bụ Umar Ganduje kwuru na ntuliaka ahụ gara nke ọ ma iji gosi na a nabara pati APC na okpuru ọchịchị iri anọ na anọ dị na steeti ahụ. 2. N'Adamawa, Bindow apụtaghị Gọvanọ na-achị Adamawa bụ Mohammed Jibrilla Bindow esonyeghi mee ntuliaka ahụ. Ndị ji ọkwa ọchịchị na steeti ahụ apụtakwaghị na ntuliaka ahụ. Ndị na-akwado Buhari dịka babachir Lawal kwuru na na ndị apụtaghị na-egosi akwadoghị Buhari ịlọghachi ọzọ dịka onyeeisiala. 3. N'Edo, anya ahụghị Oyegun A napụrụ Oyegun ohere ị ga n'ihu dịka onyeisioche pati APC iji mekwata Bola Tinubu Onyeisioche APC n'ala Naijiria bụ John Oyegun,esonyeghị na ntuliaka nke e mere na wọdụ ya dị n'okpuru ọchịchị na Bbini Isi obodo, Edo steeti. Akụkọ kwuru na Oyegun ji ihe dị mkpa n'aka nke mere na ọ gaghị ọgbakọ ahụ dị oke mkpa. 4. N'Ogun, Osoba esonyeghị Gọvanọ chịbụrụ Ogun steeti bụ Olusegun Osoba agaghị ntuliaka ime ụlọ APC nke mere na steeti ahụ. N'Anambra, Nwoye na Ngige akwatara dịka, onye zọburu ọkwa Gọvanọ na ntuliaka gara aga bụ Tony Nwoye bọrọ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Sinetọ Chris Ngige ebubo ịchọ iweghara pati APC na steeti ahụ. N'Imo, obi adịghị Rochas Okorocha ka ntuliaka ahụ sị ga nke mere ọ ọ ga kwa onyeisiala ka o tinye anya n'ihe mere n'imo. Mana dịka a na-ekwu maka ọgbahara na nsogbu so ntuliaka, onyeisioche APC na Egwu steeti bụ Ben Nwoye gwara onye ntaakụkọ BBC na ebe ntuliaka ahụ gara nke ọma karịrị ebe ole na ole e nwere ọgbaghara nke ,dịka o siri kwuo, na-egosi na APC bụ pati nwere nkwado ọchịchị onye kwu uche ya nke na adịghị dịka ndị PDP na-etinye onye masịrị ha kama ime ntuliaka. Cheta n'ụfọdụ ndị isi APC jụrụ ịga ọgbakọ ha mere, kpatara ụfọdụ ndị ji ajụ ma nsogbu dị n'ime pati ahụ ọ na akawanye njọ." afirika-44156520,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44156520,Bọjetị Naịjirịa nke 2018 ọ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka?,"N'ụbọchị Tusde bụ Mee 15, Ụlọomeiwu nke Naịjirịa binyere aka n'akwụkwọ ga-achị mkpata na mmefụ nke akpọrọ Bọjeti 2018.","Buhari nyere ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga. Bọjeti a ha binyere aka kwuru na Naịjirịa ga-emefu naira 9.120,334,988,225, bụ ọnụ ego jiri njere naira 500 karia ego dị na akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ya na mbụ. Onyeisiala nyere ha tari naira 8.612. Na ihe gosiri na gọọmentị kwusiri ike na okwu ya na ọ ga-etinye anya n'ọrụ banyere mmepe obodo ka ngalaba na-ahu maka ọkụ latrik, ọrụ na ụlọ (bụ nke akpọrọ Minsitry of Power, Works and Housing na asụsụ Bekee) bụ ndị nwetakarị ego mmefu na Bọjetị ka ha wetera Njeri naira 682 na mmanye. Na otu aka ahụ, ngalaba na-ahụ maka njem nwetara njeri naira 251 na mmanye. Onyeisiala na ndị isi otu APC nwere sọsọ ọnwa ole na ole iji gosi ndị Naịjirịa ma eji ọganịrụ bịa Ndị ọzọ bụ ngalaba na-ahu maka nchekwa nwetara njeri 157 n'ọma; ngalaba na-ahụ maka ọrụ ugbo na mmepe ime oboso nwetara njeri 149 na mmanye; ngalaba na-ahụ maka mmiri nwetara njeri naira 147 n'ọma; ngalaba na-ahụ maka azụmahịa nwetara njeri naira 105 n'ọma. Ndị nọ na okpuru bụ ngalaba na-ahụ maka akwụkwụọ na nke ahuike. Ngalaba akwụkwọ nwetara njeri naira 102 n'ọma ka Ahuike nwetara njeri naira 86 na ọma. Ngala na-ahụ maka ihe banyere Naịja Delta nwetara njeri 58,082,611,977 ka nke na-ahụ maka gbụrụgbụru nwetara mpekatampe n'ime ha niile. Ha nwetara njeri naira 17 n'ọma. Ngalaba na-ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ bu ndị nwetara ego karịa na Bọjetị 2018 Na ihe ọzọ gosiri na gọọmentị tinyere uche na ọrụ mmepe bu etụ ha sị nye ngalaba ha kpọrọ ""special intervention programme"" njeri naira 150, nye nke ha kpọrọ ""grants and donor funded projects"" njeri naira 169 na ọma, na nke ha kpọrọ ""zonal intervention projects"" nwetara njere naira 100. Ihe ndi ntoroọbịa Ndi ntoroọbịa ga-erite oru na ọrụ nwereike ipụta n'ego etinyere na ngalaba na-ahu maka ọrụ. Oru a ha ga-erite bu site na ọru ha ga-enweta ma ọru ụzọ na ọrụ ihiwe ụlo bido n'ike. Cheta na Pati na-achị bụ APC kwere nkwa na ha ga-ekepụta ọrụ nde atọ ma ha banye n'ọkwa mgbe ha na-achọ ka ebinyere ya aka n'afọ 2015. Babatunde Fashola bu Minista na-ahụ maka ngala gọọmentị aka ha di ọrụ Ka a na-akwado ntụlị aka 2019, gọọmentị Buhari ga-achọ ka ha mezuo nkwa ha kwere , nke ga-eme ka ha hu na ọrụ dị icheiche ha ji n'aka bụrụ ihe arụchara tupu ntụlị aka ebido. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49883189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49883189,DSS sị m anwala anwa yie uwe Biafra a ọzọ - Chido Onumah,Chido Onumah bụ onye ntaakụkọ kọwara ka ndị Department of State Security (DSS) si nwuchie ya n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja n'ụbọchị Ụka.,"Chido Onumha bụ onye ntaakụkọ Chido gwara BBC na o sị Sweden abata mgbe ndị DSS bịara kpụrụ ya gawa n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha gbawara ya ajụjụ ọnụ dị iche iche. Ọ sị na o yi uwe e dere ""We are all Biafrans"" mgbe ọ nọ n'ọdọụgbọelu bụ nke ọ malitere iyi kamgbe afọ 2016. Ọ sị na ha jụrụ ya ebe o sị nweta akwụkwọ ikike ndị Naịjịrịa ebe ọ bụ onye Bịafra ma yiri uwe a e dere ""We are all Biafrans"". Mana ọ sara ha na "" ya bụ onye Naịjirịa"" na uwe o yi bụ maka iji gbasa ozi maka akwụkwọ o dere a kpọrọ ""We are all Biafrans"". Onumah sị na ihe nke a pụtara bụ na ndị ọbụla nwere mmekpa ahụ na Naịjịrịa nwere ihe ha na-achọ dịka na ndị Biafra sị nwee nke ha. Dịka ọ nọchara n'aka ha awa isii ha gwara ya na ha nwetere ozi na ọ nwere ndị sị mba ofesi na-abịa ibute ọgbaaghara na Naịjirịa nke o so n'ime ha. Ha gwara na ha ""achọghizi ka m yie uwe m ahụ ọzọ, na ha ga-ejichi ya"". Mgbe ha mechera, ha gbanwee okwu ha sị na ""o nwere ndị chọrọ ịwakpo m na Naịjrịa"". Ha sị na ""na ọ bụrụ na m yiri ya bụ uwe ndị ahụ bịa, na ndị Ipob nwere ike ịbịa gbachitere m, mgbe ahụ nsogbu nwere ike ị dapụta"". Ndị DSS ahụ sị na ọ bụ nchekwa ka ha na-echekwa ya ka ndị mmadụ ghara ị merụ ya ahụ. Ha mechere jichie ya bụ uwe tupu ha ahapụ ya. Ak.ụkọ ga-amasị gị" afirika-44804062,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44804062,IPOB: Ihe ndị mmadụ sara Chimamanda maka okwu 'referendum',"Chimamanda Ngozi Adichie na BBC Igbo nwere mkparịtaụka metụtara ihe di icheiche, ọkachasị nke metụtara ala Igbo, na mbido afọ a.","Adichie bụ ode akwụkwọ turu ọtụtụ ugo di icheiche Na mkparịta uka ahụ, anyi jụrụ ya maka akụkọ banyere etụ ojiri hụ ihe mere mgbe ụfọdụ ndi mmadụ na-akwado Ipob jiri aha ya tinyere n'okwu okwughi. N'aziza ya, Adichie gwara anyị na iwe ya bụ na ndi a ji aha ya tụo asị, bụ ihe okwuru na ọ dịghị mma. Mana, na-ịga n'ihu, Adịchie kwuru na ya kwenyere n'ihe bụ isiokwu Ipob ji na-aga, bụ nke metụtara na obodo Naịjirịa adịghị enye ndị bi na ya ohere iche na ha so na obodo a. Adichie kwukwara na agbanyeghị na ya amaghị ihe Ipob sị na ọ ga abụ usoro a ga-eji hazịe onọdụ ndị Igbo na andị ọzọ na Naịjirịa, ọkachasị ebe oke Baifra ga-adị, okwuru na uche ya bụ na ụzọ a ga-eji ga bụ ihe Bekee kpọrọ ""True Federation"" Ihe ""True Federation"" pụtara ""True Federation"" bụ usoro ochi nke ga-enye steeti dị icheiche ikike inwe onwe ha n'ụdị inwe ịbụ aka jị akpa ego na-akụnaụba dị n'ala ha, ma na-enye gọọmentị etiti nwa ego. Ọ bu usoro a ka Naịjirịa jiri bido ndụ ka mba nwere onwe ya n'afọ 1960. Ndị agha chabiri atụmatụ a mgbe ha nara ndị ndọrọndọrọ ọchịchi n'ike na 1966. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a Adichie kwuru Nd ịmmadụ na-ekwu na Adichie amagaghị ihe ọ ga-ekwu maka Ipob na Biafra. Ndị ọzọ kwukwara na Adichie adịghị asụ Igbo ọfụma, makana ọ na-etinye Bekee na Igbo ọ sụrụ. Mana, onwere ndi ọzọ sị na ndị mmadụ kwesiri ige ntị n'ihe Adichie na-ekwu makana ọ na-ekwu ihe ziri ezi. N'ikpeazu ihe ọpụtala bu na Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye Igbo na-ege ntị ma bụrụkwa onye onu ya na. Akụkọ ga-amasị gị" 43021752,https://www.bbc.com/igbo/43021752,Asọmpi ịgba mgba Afịrịka ga-agwụ taa,"Kemgbe izuụka gara aga, Port Harcourt, bụ isi obodo Rivers steeti, nabatara ndị egwuregwu mgba si mba Afịrịka iri na itoolu, ndị biara maka egwuregwu akpọrọ African Wrestling Championships.","Ukoro Peter ji ọlaedo kpọọ Nigeria ihuọma n'ụbọchị mbụ nke African Wrestling Championship Mba ndị bịara asọmpi a bụ Egypt, Morocco, Guinea-Bissau, Tunisia, Algeria, Namibia, Kenya, Burundi, Senegal, Ghana, Uganda, Sierra Leone, Central Africa Republic, Madagascar na Nigeria. Ndị mgba Naịjirịa so asọmpi n'egwuregwu a dị mmadụ iri itoolu n'oke dị icheiche. Ugbua, Naịjirịa enwetala ihe nrite iri anọ na isii. Ha nwetara ọlaedo iri na isii, ọlaọcha iri na anọ na ọlanchara iri na isii nke mere ha jiri bụrụ ndi mbụ n'ọkwa n'asompi a. Onyeisi mpaghara na-ahụ maka mgba na Nigerian Wrestling Federation (NWF) bụ Daniel Igali, nyere onye na-achị Rivers steeti bụ Nyesom Wike ekele maka nkwado o nyere ndị mgba Naịjirịa na etu o siri hazie asompi a. A na-ele anya na Naịjirịa ga-anọ n'isi ndị kacha nweta ihe nrite mgbe asọmpi a ga-agwụ taa bụ Febrụwarị 11." afirika-46468098,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46468098,Father Mbaka: Ihe mere okwu ya ji akpata ụka,"Kemgbe e chiri ya ụkọchukwu na 1995, ọnwa Julaị 29, afọ 1995, Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu sitere n'ụtụtụ puo eze.","Bido n'ụlọụka Holy Ghost Cathedral bụ ebe mbụ e zigara ya ọrụ, Mbaka bidoro na-adọta igwe mmadụ n'ụka ụtụtụ n'ihi ka oziọma ya sị ada. Na e gbughị oge aha ya wusara ebe niile n'ala Igbo dịka akụkọ ọrụebube so ofufe nro ya ""Adoration Ministry"" na-agbasasị. Mana ihe ndị mere Mbaka onye ama ama na gburugburu Naijiria bụ okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị o kwurula n'elu ebe nchụaja. Ọtụtụ n'ime amụma ahụ nke ọ na-ebu na mịnịstri ya nke na-adọta puku kwuru puku mmadụ kwa izuụka, ebe ụfọdụ emezughị. Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 díka Lee ụfọdụ okwu Mbaka kwurula pụtara ụka na Naijiria: 1. N'ụbọchị Mọnde, December 2, 2018, Mbaka gwara Peter Obi, onye so Atiku Abubakar azọ dịka Osote Onyeisiala na Chineke kpọrọ aka ntachi asị n'ihi na Obi jụrụ ịkpọpụta aha ego ọ ga-enye maka ịrụ ọrụ na mịnịstrị Mbaka. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ Mbaka na-ajụ ma ọ na-eke ngọzị Chukwu naanị ndị wetara ego mana na nzaghachi ndị katọrọ ya, Mbaka kwuru sị, ""Anaghị m ana ego ikpere onye ọbụla ekpere."" 2. N'ọnwa Oktoba, Mbaka kpọrọ Atiku 'Bureau de change' n'ihi ụdị ego igwe akụkọ kwuru banyere ndị mmadụ n'aka n'oge PDP meriri na ntuliaka imeụlọ ha na Pọt Hakọt. 3. Na 2015, Mbaka buru amụma na Goodluck Jonathan agaghị emeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ ahụ n'ihi na Chineke ajụla ya, kama na Buhari ga-emeri. Amụma ya ahụ adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma ọkachasị Ndigbo n'ihi ịhụnannya ha nwere n'ebe Jonathan nọ, mana Buhari mechara merie. 4. N'ọnwa Janụwarị nakwa Oktoba afọ 2018, ka o gachara ihe dịka afọ atọ ọ batara ọchịchị, Fada Mbaka kwuru n'ozioma ya, sị,""Buhari gbanwee maọbụ a gbanwe gị"" Okwu butekwara ụka n'ihi na ọtụtụ nọ na soshal midia tara ya ụta sị na ọ bụ nkwado ya mere ka Buhari banye n'ọchịchị. 5. N'afọ 2014, Mbaka gwara ndị Imo ka ha ghara ịtụnyere Ikedi Okahim ịzọ ọkwa nke abụọ dịka Gọvanọ Imo maka iti ụkọchukwu ihe. Ohakim kpụrụ afọ n'ala na ntuliaka ahụ. Mana e mechara, Mbaka rịọ mgbaghara sị na ọ bụ asị ka a tụdoro Ohakim. 6. N'afọ 2003, Mbaka kwuru na Chimamaroke Nnamanị, onye bụbu gọvanọ Enugwu steeti agaghị abanye ọkwa ọchịchị agba nke abụọ. Amụma ahụ emezụghị mana n'otu mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45485099,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45485099,Beverly Osu o mere ihe ọjọọ iyi uwe ndị Katọlik?,"Kamgbe foto ebe Beverly Osu bụ otu onye na ndị mere ihe nkiri ""Big Brother Africa 2013"" yi uwe ndị sista Katọlik ma kpara sịga na 'chapụlet' n'aka pụtachara n'elu soshal midia, ebe ahụ e nwurula ọkụ.","End of Twitter post, 1 Ọtụtụ ndị mmadụ tụmadụ ndị ụka Katọlik akatọọla ya bụ foto ma na-adọ ya aka na ntị ka ọ kwanyere ihe niile gbasara ụka ha ugwu. Mana ebe Beverly ji nke ya see naanị foto nke akwụkwọ magazịn, ọtụtụ ndị ọcha dịka otiegwu Rihanna, Nicki Minaj na ndị ọzọ ejirila ya pụta n'ọgbọ n'emume dịka 'Met Gala: Heavenly Bodies' na 'halloween', mere ụfọdụ ndị nwere ike ghara ịhụta ya ka ihe ọjọọ. End of Instagram post, 1 Ndị katọrọ ya na Twitter: @I_pissVodka kwuru na Beverly kara iyi uwe ndị ekpere alakụba. @theDamorela kwuru na Beverly ji ihe e ji eme ekpere na-eme ihe akaja. @TWEETORACLE kwuru na dịka onye Katọlik ọ bụ, o chere na Beverly zuzuru ezuzu. Ndị akatọghị ya: Mana @Dr_Aphiz kwuru na Beverly ji ejiji ahụ na etu o si kpara 'Rosary' nakwa sịga n'aka wee na-ezisa ozi. @JAYWONJUWONLO sị na onweghị ihe dị njọ n'uwe ndị sista katọlik nwata nwaagbọghọ ahụ yi. @sirucheagbo kwuru na ihe Beverly mere bụ i gosipụta nka, ma ọ masịrị ndị mmaọ̄ụ ma ọ masịghị ha, ihe o gosiri bụ nka. @ogechime1 sị na agbanyeghị na ọ bụ onye ụka Katọlịk na o nweghị ihe ọ hụrụ dị njọ n'ihe Beverly mere. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" mba-uba-43455135,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43455135,Vladimir Putin bụ onyeisiala Rọshịa ga-achị afọ isii ọzọ,Vladimir Putin bụ onye na-achị mba Rọshịa emeriela ntuliaka e mere iji họpụta onyeisiala ụnyaahụ.,"Vladimir Putin achịala mba Rọshịa n'ọkwa Praịm mịnịsta nakwa onyeisiala Mmeri a o meriri pụtara na Putin ga-atụkwasị afọ isii n'elu afọ iri na itoolu ọ chịrịla. Ọ nọrọla n'ọkwa Praịm Mịnịsta ma chịkwaa Rọshịa afọ 19, nke bụ site n'afọ 1999 ruo ugbu a. Na ntuliaka e mere, Putin nwetara vootu 76 pasentị, karịrị 64 pasentị o nwetara n'afọ 2012. Ebe Pavel Grudinin bụ onye na-achụsị Putin ike nwetara 12 pasentị, Ksenia Sobchak nwetara pasentị abụọ ebe Vladimir Zhirinovsky nwetara pasentị isii. A kwụsịrị Alexei Navalny bu ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide n'isi iso zọọ ndọrọndọrọ. Ihe Putin kwuru Ka o merichara, Putin gwara igwe mmadụ gbakọrọ na Mosko na ndị tunyeere ya vootu ""hụrụ ihe ọma ndị o mepụtara n'afọ ole na ole gara aga"". Oge ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ gbara ya gbasara ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ma afọ isii nke a gachaa, O chịpụrụ ọchị ma sị ""ihe ị na-ekwu na-atọ ọchị. Iche na aga m anọ ebe a ruo oge m gbara afọ 100? Mba!"" Ndị otu ya gwara Interfax nke Rọshịa na ọ bụ ""ezigbote mmeri"" ""Pasentị a anyị na-ahụ ugbua na-ekwuru onwe ya. Ọ bụ ihe Putin ga-eji mee mkpebi n'afọ ndị na-abịa n'ihu, o nwekwara ọtụtụ mkpebi ọ ga-eme."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56798669,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56798669,"Lee mwakpo niile 'unknown gunmen' mere na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ụbọchị April 19, 2021","Akụkọ mwakpo mbụ si mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa chee ụwa ihu n'ụtụtụ taa bụ April 9,2021 bụ nke mere n'Ukpo dị n'Anambra steeti.","Ndị o ji egbe egbu wakporo ụlọọrụ ndị uweojiii Zone 13 bụ isi ụlọọrụ n'elekere anọ nke ụtụtụ taa mana ndị uweojii kwụsiri ha tupu ha mebiwe ọtụtụ ihe. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Zone 13 bụ Nkeiruka Nwode kwuru na ya ndị otu ya chụmiri ndị omekome ahụ ọsọ ụkwụ eru ala ma napụta ha ngwa ọgwụ gụnyere egbe. Onye na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya hụrụ ihe merenu kwuru na ndị uweojii abụọ nwụrụ n'ọdachị ahụ. Mbọ niile onye ntakụkọ BBC gbara inụta n'ọnụ onụ na-ekwuru ndị uweojii ebe ahụ kpụrụ n'ala makana o bughị ekwe nti ya. Kirie ka ebe ahụ dị ugbua. Onụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenganyia kwetere na ya bụ mwakpo mere mana o kwughị na o nwere onye nwụrụnụ. Ka ọ dị ugbua , ndị mmadụ na-agagharị eme ihe nke ha mana ọtụtụ ndị uweojii juputere n'akụkụ ebe mwakpo a mere. Njiji jikwara n'Uzuakoli dị n'Abia steeti Ndị uweojii nke ụlọọrụ dị n'Uzoakoli kwuru na enweghị onye ọbụla nwụrụ na mwakpo ụloọrụ ha dị n'Ụzọakọlị, nke okpuruọchịchị Bende dị n'Abia steeti.Onye ntaakụkọ BBC garụru ebe ahụ kwuru na ọ bụ n'ihe dịka elekere iri abụọ nke ụtụtụ ka ndị a wakporo ya bụ ụloorụ a.Ha gbara ụlọọrụ ndị uweojii a ọkụ ya na ụgbọala ndị nọ ebe ahụ. Anyị ejidela mmadụ ise aka ha dị n'ogbugbu mmadụ n'Awka n'ụbọchị Sọnde - Ndị Uweojii Taa ka ndị Uweojii nọ n'Anambara steeti kwuptere na aka ha akparala mmadụ ise a na-eche na aka ha dị n'ogbugbu mmadụ mere n'ụbọchị ụka n'isi obodo steeti ahụ bụ Awka. Nke a na-abịa dịka ndị amabeghi ndị ha bụ gburu ihe a na-eche ruru mmadụ ise na Aroma Junction na Unizik Junction n'abalị Sọnde. Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ ekweghị ekwu okwu n'onyonyo mana ha kwuru na a na-eche na ọ bụ ndị otu nzuzo kpara ike a. Mkpa mkpa a na-ebo ndị otu nzuzo na-akpasi ike n'Anambara na nso nso a. Ndị uweoji kwukwara na ha na-agba mbọ ịkwụsị ya site n'ime ka ndị ntorobịa mata na uru adịghị n'isonye na ụdịrị atụmatụ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43939674,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43939674,Dino Melaye awụfela oku mkpọghachi,"Sinetọ Dino Melaye esila n'akwa ọ nọ n'ụlọọgwụ kele ndị mpaghara Kogi-West ọ na-anọchite n'ụlọomeiwu ukwu, maka ịjụ mbọ a na-agba iji kpọghaachi ya ma sị na ya agaghị ekwe ka ajụ ha daa n'ala.","Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu Atụmatụ ịkpọghachi Dino Melaye iji wepụ ya n'ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sineti akpụọla afọ n'ala dịka e nwetaghị mmadụ ole iwu ntuliaka kwuru tinyere aka n'akwụkwọ ahụ. Melaye kwuru n'igwe okwu Twitter sị: ""Ana m ekele ụnụ ndị nke m. Chukwu gozie unu, ekele dịrị unu maka ntukwasiobi unu nwere na m. Agaghị m ekwe ka ajụ ụnụ daa n'ala. Aga m akwụgide n'eziokwu ma kwụnyere ndị mmadụ oge niile. Chukwu gozie Kogi-West. End of Twitter post, 1 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC n'aha ịchafụ kwuru n'ụzọ ụtụtụ taa bụ ụka na ọ bụ naanị mmadụ pasentị 5.34 pụtara binye aha ha n'akwụkwọ nke e mere na Satọde, ebe iwu kwuru na ọ bụ ma pasentị 50 mmadụ binye aka n'akwụkwọ mkpọghachi ka e nwere ike i wepụ onye sineti. Na nchịkọ ka o siri ga, kọmịshọna Inec Benue steeti bụ Prof. Ukertọr Gabriel Moti kwuru na ọ bụ mmadụ otu puku narị na iri asatọ na itoolu, nari asatọ na iri asaa na (189, 870) binyere aka n'akwụkwọ mkpọghachi melaye, ebe naanị mmadụ puku iri abụọ (20,000) bịara maka ikwuputa n'ezie na ha binyere aka n'akwụkwọ nke ọ bụ naani mmadụ puku iri na asatọ na otu narị na iri asaaa na iri anọ na atọ (18,743) ka a hụrụ aha ha. O kwukwara na ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha maka ntuliaka na Kogi-West dị narị puku atọ, puku iri ise, otu puku, otu narị na iri anọ (351,140). Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45830304,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45830304,Orji Kalu abaala mmiri ọkụ ọzọ maka Nnamdi Kanu,Otu ụlọikpe etiti n'Abuja emeela mkpebi ọhụrụ ka onye chiburu dịka gọvanọ Abia steeti bụ Orji Kalu za ajụjụ gbasara ebe Nnamdi Kanu nọrọ.,"Orji Kalu ji afọ asatọ chi Abia Steeti Ụlọikpe a kpebiri na Orji Kalu ga-abịa za ajụjụ n'ụbọchị iri na anọ n'ịme ọnwa Novemba. Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ụlọikpe kpọrọ Kalu. O kwukwara na onweghị ihe ọzọ Orji Kalu ga-eme na bụghị ịwụchịrị n'ụlọikpe. Oku a na-abia makana akụkọ wuru ewu n'ime ọnwa garaaga kwuru na Kalu gwara ndị ntaakụkọ na Nnamdi Kanu nọrọ London. ""Anyị ga-edulata nna mụrụ Nnamdi Kanu"" - Ikpeazu N'akụkọ nyiri ibe ya, gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ekwuola na Eze Obodo Afaraukwu Ibeku bụ Eze Kanu ma bụrụkwa nna onyeisi ndị otu IPOB ga-alaghachite na be ya n'oge na-adịghị anya. O nweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ ruo ugba Ahubeghị nna Nnamdi Kanu kamgbe ndị agha Naijirịa wakpochara obodo ahụ n'afọ garaaga. Ikpeazu kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-agba mbọ ịhụ na nna Nnamdi Kanu laghachịtere azu n'udo. Okwu a ka ọ sara ndị Obodo Afaraukwu Ibeku mgbe ha rịọrọ gọvanọ Ikpeazu ka ọ kpọlatara ha Eze ha. N'ọnụ okwu Ikpeazu: ""Anyị niile ga-agba mbọ hụ na Eze Kanu batara na bee ya tupu ngwụcha afọ ọhụrụ a"" Ikpeazu kwukwara na gọọmentị etiti emeghị ka gọmentị ya mara tupu ha ejiri ndị agha wakpo obodo Afaraukwu n'agha akpọrọ ""Operation Python Dance"". O kwuru na: ""Echetera m na anọghị m na Naịjirịa oge Operation Python Dance mere. Alaghachiri m ngwa ngwa nakwa kpọ ọgbakọ n'etiti ndị eze maka idozi okwu a."" Gọvanọ Ikpeazu kwukwara na ndị Afaraukwu bụ obodo ndị udo, na gọọmenti ya ga-agba mbọ ị hụ na o mere ọtụtụ iheọma n'obodo ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-52422905,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52422905,Lee ihe anọ ị na-ekwesịghị ịgwa nwatakịrị na-erubeghi afọ 18,Ụwa atụgharịala ugbua nke mere na nwatakịrị na-erubeghi afọ 18 abụrụbeghi okoroobia maọbụ agbọghọbịa.,"Mgbe gboo, e nwere ndị na-erughi afọ 18 tupu a lụnye ha nwunye maọbụ di, mana ihe ndị ahụ abụrụla ezigbo arụ n'ụwa ugbua. N'otu aka ahụ, e nwere ụdịrị ihe ndị ị ga-agwanwu nwa ka na-eto eto mgbe ahụ ọ ghara ịbụ njọ maọbụ arụrụala, ọ bụghị na ihe ndị ahụ adịghị njọ ma ị nọrọ ala chee ya eche oge ahụ. Mana etu ụwa dị ugbua, ị kwesịghidị itinye ya n'uche gị ma ya fọdụzịa ikwupute ya n'ọnụ gị. Kama ịgwa nwatakịrị ihe ndị ga-emerụ ya ahụ maọbụ tinye ya na nsogbu dịka ọnwụnwa, ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịlekọta ụmụaka na-enye ntuziaka ka ị mara ihe ndị ga-enyere ha aka. BBC Igbo kpọkuru Denis Onoise na Ngozi Okoro bụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara ụmụaka, ndị kwuru sị na ọ kacha bụrụ ọrụ dịrị nne na nna ịkọwara ụmụaka ihe ndị a. Ihe ndị ị na-ekwesịghị ịgwa nwa na-etorubeghi afọ 18 1) Agwala nwatakịrị ""Ị kpụọla ara o"" maọbụ ""lekwa etu ike gị ha"": Ha kọwara na ọ na-abụkarị onye nọ nso na-emebikarị ụmụaka, nke bụ na mgbe okenye malitere ịgwa nwatakịrị ụdịrị okwu a, e nwereike o tinyewela anya ọjọọ n'ahụ nwa ahụ. Ha kwuru na ọ ka mma nne na nna ikuziri nwatakịrị maka ahụ ya tupu ọ mụta ya n'ezi. Dịka ndị ọkachamara a si kwuo, ọtụtụ oge, ịmụta ya n'ezi bụ ihe na-achịpụta ụmụaka ụkwụ n'ama, ma mee ka ụmụaka 'mebie'. Ha kwukwara sị kpọọ ya aha ọ bụ dịka ""ọtụ"", ""amụ"" ka ha mara, kama ịkpọ ya ihe yiri ya n'ihi na ị chọghị ịkpọ okwu aha. 2) Akpọla nwatakịrị ""di m"" maọbụ ""nwunye m"": Ha kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ okenye ịkpọ nwa na-etobeghi eto ihe ndị a, n'ihi na ọ na-agbagwoju ụfọdụ ụmụaka anya. Ụfọdụ okenye na-eji ohere ahụ arafu ụmụaka, sị ha ""bịa ka anyị mee ihe di na nwunye na-eme"". Ọzọ bụkwa na iwu Naịjiria megidere nwatakịrị na-erubeghi afọ 18 ịlụ di maọbụ nwunye, nke bụ na okenye e jidere ka ọ na-akpọ nwatakịrị aha a adaala iwu nwereike itinye ya na nsogbu. 3) Agwala nwatakịrị ""ọ dị ka ị chụwala nwaanyị"" maọbụ ""ọ dị ka i sowela nwoke"": Ịgwa nwa na-etobeghi eto ụdịrị okwu a nwereike itinye ya na nsogbu dịka ịmụta ihe gbasara akwamiko na-etobeghi eto. Ụfọdụ na-eji ohere ahụ egosi ụmụaka ihe nkiri ndị gba ọtọ, ọkachasị ma ha ghọgbuchaa ha ebe ha ga-asị ha na na-egosi ha ndị ""dị ka ha"". 4) Akpọla nwatakịrị aha ọjọọ: Aha ọjọọ ndị dịka ""itibọrịbọ"", ""isi akị"", ""onye umengwụ"", ""efulefu"", ""akwụna"" ""onye oshi"" wdgz, bụ aha ndị nwereike inye nwatakịrị nsogbu. Ị na-ajụ etu ọ bụ? Ha kwuru na nwatakịrị a na-akpọkarị aha a nwereike imalite ikwenye n'ime ya, nke ga-eme ka ọ kpawa ụdịrị agwa ahụ a na-asị na o nwere. Ha kwuru na nke a ga-eme ka nwa ahụ chefuzie maka ịgba mbọ, ọ ga na-asị ma ọ bakwaranu uru ebe ọ bụ na ọ gbara mbọ ma ọ gbaghị aha ọjọọ a kpọrọ ya ka ọ na-aza. Ha kwukwara na n'ihi na e nwere ụmụaka uche ha akachabeghi aka, ụfọdụ nwereike gbuo onwe ha n'ihi okwu ọjọọ a gwara ha. Ihe ọzọ ndị ọkachamara kwekọrịtara na ya bụ na ọ ka mma nne na nna kụziri ụmụ ha ihe ndị a nwereike itinye ha na nsogbu n'aka okenye na-awakpo ụmụaka, tupu ha amụta ya n'ezi. N'ihi na a mụta ya n'ezi ọ na-abụkarị nke ọjọọ na-ebute nsogbu. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-47580199,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47580199,Alex Iwobi: Ndị mmadụ ji ogbo na ncha saa onye egwu Arsenal ahụ maka isu imi,Arsenal nyere Rennais ọkpụ atọ chara ọkụ n'abalị Tọọzde oge ha zutere na Emirates Stadium mana nke ahụ anaghị ewu.,"Alex Iwobi nke Arsenal na Hamari Traore nke Rennais nwere kwanta oge otu egwu ha zutere n'abali 14 nke ọnwa Maach, afọ 2019 Ihe na-ewu banyere asọmpị ahụ bụ na Alex Iwobi zuru Hamari Traore imi. End of Twitter post, 1 Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na Alex Iwobi ikpuchi imi ya ngwa ngwa Traore ruru ya ahụ bụ 'nwanne ịkparị nwa nne' dịka Traore bụkwa onye isi ojii dịka ya. Cheta na ọnwa gara aga, nwada Indịa bụ Esha Gupta jiri ịbụ onye isi ojii kparịa Iwobi nke mere ụwa niil jiri chọọ iri ya na ndụ. N'ozi ọtụtụ wepụtara na Twitter, ha jị ncha na ogbo saa Iwobi ahụ maka 'agwa ọjọọ' nke ha sịị na o gosiri mkparị. @Ellyment247 sịrị na Iwobi bụ awọ na-akpọ awọ ibe ya wọkọm, na o mechuru Afrika ihu. @lordballack04 kwuru na ya anụbeghị ka Arsenal maọbụ NFF maọbị Austine Okocha katọrọ ihe Iwobi mere mana na ọ bụrụ onye ọzọ mere Iwobi ụdị ihe a ha etiwe mkpu. @AlbertAnkomah kwuru na ndị ihe Arsenal na-amasị nwere ike were ihe Iwobi mere dịka ihe ọchị mana ọ bụ ihe mkparị. Mana ụfọdụ ahụghị ihe ọjhjọọ dị n'agwa ya @The_Logical_ jụụ sị, ọ bụrụ na ọnụ mmadụ na-esi isi, ọbụ na m enghị ikike igbuchi ọnụ? @darlinojim kwuru na ihe Iwobi mere bụ ihe kwesịrị ekwesị n'ihi na ọ bụ iji uche gbara nsogbu ọsọ." 48529718,https://www.bbc.com/igbo/48529718,Abacha loot: Ụmụ Naijiria chọrọ ịtapụ Abacha nti ya,Anaghị ekwu ajọ okwu maka onye nwụrụ anwụ mana ụmụ Naijiria ekweghị na nke a n'ebe ọ gbasara onyeisiala chibụrụ Naijiria bụ Sani Abacha.,"A na-eche na Abacha zupuru ihe ruru ijeri dọla abụọ na ụma mgbe o bubu onyeisiala Naijiria Ọtụtụ ha egosiputala itunanya dị ukwu dịka na-achọputa ego a sị na Abacha zupuru oge ọ chịburu. N'ụbọchị Tuzde, ụlọikpe dị na mba Briten nyere iwu ka e jichie narị paund abụọ na iri na otu nke pụtara ijeri naira iri asatọ na abụọ (N82 billion) bụ nke ha si na Sani Abacha zupụrụ. Akwụkwọ akụkọ Metro.UK kwuru na ọ bụ n'aha ụlọ ọrụ British Virgin Islands a kpọrọ ""Doraville Properties Corporation"" ka Abacha zoro ego ahụ. Ọtụtụ ndị tinyere ọnụ n'okwu ahụ gbapụru ụrịọm kwuo na Abacha mekpọrọ ala, ebe ndi ọzọ ji ya akpa ọchị na-ekwu na ya bu onyeisiala ka na-ezitere Naijiria ego n'agbanyeghị na ọ nwụọlari ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga. Lee ihe ha na-ekwu: @stjudendukwe kwuru na Abacha nwekwara ike izuru ọkụ nile dị n'ọkụmmụọ @OgbeniDipo n'aka nke ya si na Abacha zupuru Nigeria mkpụrụ ọkwụrụ n'anya. Ọ gbagwojuru @DaParrot anya ihe kpatara Naijiria ji ka nọdụ n'ụbiam nakwa agba mbibi ego ebe ọ bụ na enwetara ego buru ibu otua n'aka Abacha. @snowice91 kwuru na Abacha bu onyeisiala chiburu Naijiria kacha nwee obiọma nke na ọ naghị ahapụ izite ego kwa mgbe kwa mgbe. @OncleDavidJosh jụrụ ihe ejirila ego ndị mbu e nwetara n'aka Abacha mee. @ArewaTwiter sịrị na Abacha enyela Naijiria onyinye Sallah. @el_shuaybb rịọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o were ego ahụ mee ihe bara uru. Lekwa ihe ndị ọzọ kwuru maka ya: Kemgbe Abacha nwụchara n' afọ 1998, gọọmentị Naijiria ewechighatala nnụkwuru nnụ ego bụ nke ha sị na Abacha zoro n'ọbaego dị iche iche n'akụkụ ụwa nile. N'afọ 2018, gọọmenti mba Swizzerland nyeghachiri Naijiria narị nde paunds atọ (£300 million) bụ ego Abacha zupụrụ. Akụkọ ga-amasị gi: Akụkọ na anyị anwụrụla Rochas bụ asị ọcha - EFCC" afirika-55966778,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55966778,Nutrition: Nri ndị ị kwesịrị iri kwa ụbọchị iji kwụrụ chịm,"Ka ị na-eri nri kwa ụbọchị, ị ma na e nwere nri ndị dị mkpa ka i na-eri kwa ụbọchị ka ị nwee ike na-anọ n'ezigbo ahụike?","Nri ndị a dị mkpa n'imezi ahụ mmadụ site n'ime ahụ pụta n'ezi, mana ọtụtụ ndị amaghị n'ihi na ha na-eri nri naanị ka ha wee dị ndụ karịa iri nri maka ndozi ahụ na ezi ahụike. Ọtụtụ n'ime ha bụ ngwanri ndị ị ma nakwa na-ahụ oge niile, mana ị maghị etu ị ga-esi tikọta ya wee rie ya ka ọ rụọ gị ọrụ n'ahụ. Nri ndị a na-enye ihe dị iche iche n'ahụ gụnyere Vaịtamin, abụba na mmanụ, mgbadoume, mịneralụ, odozi ahụ nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche. E nwere ụzọ nri ise mmadụ kwesịrị ịgbado anya ma ọ na-eri nri kwa ụbọchị: 1) Mkpụrụosisi: Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ọ na-enye n'ahụ ekwuola na mkpụrụosisi dị mma n'ahụ maka ụdịrị ọrụ ọ na-arụ. Mkpụrụosisi nwere ihe Bekee na-akpọ 'fiber' nke na-enyere aka ịgbari nri n'ahụ ma mee ka nri nwee ike igazu gburugburu ahụ mmadụ. Ha nwekwara shuga nke ha, nke bụ na ọ bụrụ na ị na-asọ shuga, ị nwereike itinye mkpụrụosisi na nri gị were ya mere shuga ị ga-eji rifee nri gị. Ma o kweghi gị aracha maọbụ ata, ị nwereike ịkwọ mkpụrụosisi gị akwọ ṅụfee ya ka mmiri. Mkpụrụosisi gụnyere unere, oroma, akị, ube, mangoro, oroma nkịrịsị, icheku wdgz. 2) Akwụkwọ nri: Nke a bụ otu ụzọ nri i nwereike iji rijuo afọ ma na-erighi oke nri. Ndị Igbo nwere ọtụtụ akwụkwọ nri dị iche iche nke a na-eji esi ofe nakwa nri ndị ọzọ. Mana ị ma na ọ bụghị oge niile ka ị kwesịrị isi akwụkwọ nri gị n'ọkụ? Ụfọdụ akwụkwọ nri na-adị mma ka o ghara ide ede, ka ihe ndị ọ na-eji edozi ahụ nke Bekee kpọrọ 'nutrients' nwee ike ka ju n'ime ya mgbe mmadụ na-eri ya. Akwụkwọ nri gụnyere ụgụ, ụzịza, onugbu, ọkazị, ụtazị, tomanto, ndukwu, karọt, wdgz Ero, ọka nakwa ụfọdụ agwa bụkwa ụdịrị akwụkwọ nri. 3) Odozi ahụ (Protein) Nke a so n'ụdịrị nri kacha mkpa ka mmadụ na-eri kwa ụbọchị. Ọ dị mma iri maka ndozi akwara nakwa ngagharị ihe dị n'ime ahụ; ọ na-enyekwa aka ime ka mmadụ rijuo afọ. Odozi ahụ gụnyere mmiri ara ehi, ụdịrị azụ dị iche iche, nshịkọ, ịsha, anụ dị iche iche, akwa, nakwa mkpụrụ gụnyere kashu, ahụekere wdgz. 4) Mkpụrụ: Ihe ọṅụṅụ eji Soya mee na a dị mma n'ahụ Mgbadoume nke Bekee kpọrọ 'carbohydrate' abụchaghị ihe ọjọọ dịka ụfọdụ ndị na-ekwukarị. Ụfọdụ na-enye aka n'idozi ahụ, ọkachasị ndị nke nwere 'fiber' ahụ, n'ihi na ha na-ejide gị ka mgbadoume, mee ka agụụ ghara ịgụ gị ọsịsọ. Ụfọdụ mkpụrụ dị mma iri gụnyere achịcha e ji nke Bekee kpọrọ 'whole wheat' mee, osikapa na-acha aja aja, 'oat', 'whole-wheat pasta', quinoa, soyabean wdgz. 5) Nri si na mmiri ara ehi: A na-esi na mmiri ara ehi emepụta ihe dị iche iche na-edozi ahụ. Ụfọdụ na-abịa dịka abụba ebe ndị nke ọzọ na-abịa dịka odozi ahụ; nke na-eme ka afọ ju gị mgbe i richara nri, kama e kwesịghị iribiga ya oke. Nri ndị si na mmiri ara ehi gụnyere yogọtụ, chiiz, bọta wdgz. Na nchịkọta, nri mmadụ na-eri kwa ụbọchị kwesịrị ịgụnye ọbụlagodi otu ihe n'ime ụzọ nri ise ndị a (ya bụ họrọ otu ihe otu ihe n'ime ụzọ nri ise a jiri mejuputa nri gị kwa ụbọchị). Irikọta ha ọnụ kwa ụbọchị ga-enye aka ibelata ụjọ ọrịa obi, site n'ime ka mmadụ ghara inwe ọbara mgbalielu nakwa nnukwu kọlesterọl, dịka ngalaba NHS nke mba Briten si kwuo." afirika-49381103,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49381103,Igbo Music: Egwu anọ e ji mara ndị Igbo,Egwu bụ ihe e ji mara ndi Igbo. Igbo bụkwa ndị egwu na-amasị nke mere na ị ga-ahụta ya n'ihe dị iche iche Igbo na-eme.,"Ma ọ bụ ihe aṅurị, maọbụ ihe nwute, Igbo nwere egwu ha nwere maka emume ndị a. Igbo na-asị na agadị nwaanyị anaghi aka nka n'egwu ọ maara agba, nke mere na edemede a ga-egosipụta ụfọdụ egwu e ji mara ndị Igbo. Ọ bụghị iwu na egwu a niile bụ ndị Igbo bidoro iti ha, kama ọ na-amasị ndị Igbo, nke mere na e jizi ya mara ha. BBC Igbo juru ọkachamara n'ihe gbasara egwu Igbo na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka bụ Gerald Maduabuchi Eze, ajụjụ maka isiokwu a, soro anyị ka ị mụta ihe ọ gwara anyị: 1) Egwu 'Highlife' Eze sị na 'Highlife' bụ egwu na-amasị ndị Igbo nke ọma. Ọ sị na o nweghị onye ga-asị lekwa ebe 'Highlife' siri bido, mana ụfọdụ na-ekwu na o sitere na mba Gana. E ji ụbọ latrik mara egwu 'Highlife' Akwụkwọ 'Encyclopedia Britannica' kọwara na ""Highlife"" bidoro na ngwụcha nchịkọta oge ndị Bekee kpọrọ ""19 century"". Akwụkwọ a na-achịkọta amamihe kọwakwara na ọ bụ egwu ọdịnala na nke Bekee kpọrọ ""Jazz"" ka e ji mejuputa Highlife. Eze kwuru na ""otu ihe anyị ma bụ na Gana, Naijirịa na Siriya Lone nwere aka n'ihe gbasara mbido egwu Highlife. ""Ị nwereike ịsị na mba atọ ndị a nwere aka n'ihazi egwu Highlife ka ọ bụrụ ihe ọ bụ taa."" Ọ sịkwa na tupụ a kpọwa ya Highlife, aha e jibu mara ya bụ ""Pammy Music"". Dịka aha ya bụ Highlife, ọ bụ naanị ndị ọgaranya ka a na-akporọ egwu a, mana ka oge na-aga mmadụ niile bidoro gewe Highlife. Ndi ọkammuta n'ihe gbasara egwu dịka Eze na-akọwa na o nwereike ịbụ mgbe ndị ọcha bịara Afrịka ka ha kuziere ndị Afrịka etu e si akpọ ụbọ. Ka oge na-aga, ndị Afrịka bidoro were ụbọ na-agụ egwu akụkọ ifo na egwu ọdinala ndị ọzọ. Nke a kacha bụrụ ihe ngosi na-akọwa etu Highlife siri bido. Njirimara Ị gee Highlife nke ọma, ị ga-anụ ụda ọdinala na ụfọdụ ihe egwu bụ njirimara ndị Afrịka. Akụrụngwa egwu kacha pụọ iche na Highlife bụ ụbọ Bekee nke a na-akpọ 'Electric Guitar'. Ịgba, ekwe, ịchaka na ụfodụ ngwa ndị ọzọ na-eso n'egwu Highlife. Ndị ọsụ ụzọ Igbo niile gburugburu na-akpọ egwu Highlife, ọkachasị ndị Anambara steeti. Ụfọdu ndị mere ka e jiri Highlife mara ndị Igbo bụ Prince Nico Mbarga, Osita Osadebe, Oriental Brothers na Oliver De Coque. 2) Egwu Ekpili Mbido Ekpili bụ egwu nnanna anyị ha bidoro nke mere na o nweghị onye nwere ike ikọwali mgbe o jiri bido. Njirimara O bụ ọkpọkọrọ, ịchaka na Ekpili bụ ngwa egwu mere ka egwu a pụọ iche. Egwu Ekpili na-abukarị 'a kpọọ a zaa'. Ihe nke a pụtara bụ na otu onye na-agụ, ndị egwu ya azaa ya. Dịka Akunwafor Obiligbo si agụ ya, I nwere ike inụ ihe dịka 'Nwanne jirikwa nwayọọ oo' A zaa ya sị 'Ooo Obiligbo onye ọma'. Dịka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị egwu na-etinyekwa ngwa egwu ndị agba ọhụrụ dịka Ubọ Latrik na 'piano'. Onye na-agụ egwu ekpili mara etu e si etu dike aha ka o mee ihe o ji bụrụ dike. Ịchaka na Ọkpọkorọ Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ ndị Anambara ọkachasi ndi Ọnịcha, Nsugbe, Nteje, Aguleri dgz. na-agụkarị Ekpili. Morocco Maduka gbanwere egwu Ekpili nke mere ya ka ọ tọkwuo ụtọ. Ọ bụ ndị dịka Akunwafor Ezigbo Obiligbo, Emeka 'Morocco' Maduka, Oliver Sunday Akanite (Oliver D'Coque) na Ozoemena Nwansugbe ndị na-etinyekwa ụbọ oyibo na Piano ka e ji ya mara. Ugbua Ọ bụrụ mgbe gboo, onye na-eti egwu Ekpili anaghi agụ ya maka ego. Nke a mere na onye omekome anaghị anọ ebe onye na-eti egwu Ekpili na-eti egwu . Maka na onye egwu Ekpili ga-agwa ya ihe ọjọọ ọ na-eme n'ihu ya. Mana anyị amaghịzị ma ọ ka dịkwa etu a. Ụmụ ụmụ Obiligbo ka na-etikwa egwu dịka nnanna ha siri tie. Okpuozor na Akunwafor - ụmụ ụmụ ka na-etikwa egwu ka papa nnukwu ha. 3) Egwu Njima Mbido Dịka Ekpili, Egwu Njima bụ egwu nnanna anyị ha bidoro nke mere na o nweghị onye nwereike ịkọwa mgbe o jiri bido. Njirimara Etu e si agụ Njima na-egosiputa mmekọrịta dị n'etiti ngwa egwu na onye na-agụ ya. Ngwa egwu e jiri mara Njima gụnyere Ọja, Ogene, ekwe na Ịgba mgbe ụfọdụ. Ọ na-adị ka abụ nke ndị Bekee na-akpọ 'Lead and Chorus'. Dịka Perikoma siri gụọ: ""M weere udọ ka m kwụgbuo nwanne m mana obi nwanne mere m o."" ""M were ka m gbuo nwannem mana obi nwanne mere m o"" Ndi egwu ya agụọ: ""Izu ka mma na nne ji ka ị mara"" Ọkammụta ihe gbasara egwu Gerald Eze n'afụ Ọja Ọ bụkwa n'egwu Njima ka ị ga-ahụ onye na-agu egwu ka nye na Oja ma ọ bụ Ekwe na akparịta ụka. Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ Mezuo Okoye (Pericoma) mere ka ndị mmadụ mara egwu Njima. 4) Egwu Ogene Ewgu Ogene na-akpali mmụọ mmadụ Mbido Onye ka anyị ga-ajụ etu egwu ogene siri bido? Anyị a ga-ajụ ndị Enugwu steeti? O nweghị ebe e dere sị lekwa etu egwu ogene siri bido. Njirimara Ihe e ji mara Egwu Ogene bụ na ọ na0-abụkarị Ogene mkpi. A na-enwe nke Nne Ogene na Oke Ogene. Nne Ogene na-ada nwayọ ebe nke na-adasi ike bụ Oke Ogene. Ndị a na-eche bidoro egwu Ogene bụ ndị Enugwu Steeti. Mana ka ọ dị ugbua, ị ga-enweta ya taata n'Ọka, Ụmụuchu, Enugwuukwu na ọtụtụ ebe n'Anambara Steeti. Ụfọdụ ndị na-eti egwu Ogene dịka UduBunch, na-etinye nke ha ịgba. Ụfodụ na-etinyezi ọja, udu na ịchaka. Ndị ọsụ ụzọ Ọ bụ ndị Egwu Ubo Amaọdụ nke Ọkụnanọ bu ụzọ tie egwu ogene ma ree ya dịka ahịa. Ndị dịka Shidodo na-etinye nke ya opi na ngwa egwu ndị ọzọ, Malaịka so na ndị mere ka egwu a wuwe ewu. Anyị sị ka anyi dewe maka egwu Igbo, anyị agaghị edecha edecha. E ji ụbọaka mara 'Area Scatter' Ndị dịka Area scatter, Nelly Uchendu na Mike Ejeagha bụ ndị dị mkpa n'ihe gbasara egwu Igbo. Kedụ egwu ndị ọzọ ị ma? Lee Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị: Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha" afirika-45417839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45417839,Kedụ ihe ndị dị gị oke mkpa ịzọpụta ma e nwee ọdachi?,"E nwee ọdachi dịka ọkụ ọgbụgba maọbụ oke idemmiri, kedụ ihe ndị dị mmadụ oke mkpa ịzọpụta n'ụlọ ha?","Ọtụtụ oge ka ụlọọrụ dịka ndị ọrụ gbatagbata bụ NEMA na-ezisa ozi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị maka ọdachi dịka oke idemmiri nwere ike imebicha ihe na ihe ndị ọzọ. N'agbanyeghi ịdọ aka na ntị a, ọtụtụ oge ka ihe ndị mmadụ na-ala n'iyi maka amaghị etu a ga-esi mee maọbụ maka atụwaghị anya na ọdachi ahụ ga-eru etu o si ruo. Ihe na-emezị bụ na ọdachi ahụ mee, ihe ndị dịka ụgbọala, akwụkwọ na-egosi ihe mmadụ nwere nke Bekee kpọrọ 'document', ego, asambodo, ọla dị iche iche na ihe ndị ọzọ na-emebi. Ọdachi dịka oke idemmiri nakwa ọkụ ọgbụgba atakwaala isi ọtụtụ ndị mmadụ. Ihe ị kwesịrị iwe n'ụlọ n'ọdachi idemmiri Nnanyelugo Ezeanị bụ onye na-arụ n'ụlọọrụ Nema n' Enugwu, gwara BBC Igbo ihe ndị mmadụ ga-ewe ma ha na-agba ọsọ ndụ n'ụdịrị ọdachi a. Lee ihe mbuze na-eme n'ala Igbo. Mbuze achụpụla ndị mmadụ n’ụlọ ha na Nanka Lee ihe ndị mmadụ zara oge BBC Igbo jụrụ ha ihe ha ga-eme ma ha nwee ụdịrị ọdachi a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-45300481,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45300481,George Weah enyela Arsene Wenger nturuugo na Liberia,Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah ebunyela Arsène Wenger bụbu onye nchịkọta otu Arsenal ụkpa ekele ka o na-enye ya nturuugo kachasị elu na Liberia nke a kpọrọ 'Knight Grand Commander of the Humane Order of African Redemption'.,"Wenger kpọtara ma zụọ Weah oge ọ na-agba bọọlụ na Monaco, n'afọ 1988 N'emume ịnye nturuugo a mere n'isi obodo Monrovia, Weah bụ onye ọgba bọọlụ mbụ mechara bụrụ onyeisiala nakwa naanị onye Afrịka riterela 'ọkacha agba na mbaụwa n'otu afọ nke Fifa' kwuru sị: ""Ị gosiri onwe gị dịka onye nkuzi a na-agaghị echefu ọsịsọ oge ị gbanwere etu e si achọpụta ndị ntorobịa nwere ọnatarachi n'ịgba bọọlụ na gburugburu ụwa, ọkachasị mpaghara Afrịka."" John Kuffour bụbu onyeisiala mba Gana na Wenger na-akpa nkata Claude Le Roy bụ onye nchịkọta bu ụzọ gwa Wenger maka Weah, nwetakwara nturuugo a. Ọtụtụ ndị mmadụ ṅụrụ ọṅụ ka Weah nyere Wenger nturuugo ya na Samuel Kanyon Doe Sports Complex dị n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ nke obodo ahụ. Obi bụ Wenger sọ 'pọlịna pọlịna' Onye ntaakụkọ BBC bụ Jonathan Paye-Layleh, kwuru sị na ụfọdụ ndị Liberia na-ewe iwe na-ekwu na ekwesịghị inye mmadụ nturuugo naanị maka ihe o meere onyeisiala n'onwe ya. Mana Eugene Magbe bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Liberia gwara BBC na nturuugo a abụghị maka ihe jikọrọ Weah na Wenger, kama na ọ bụ ụzọ e si aghọta na Wenger ""gbaara egwuregwu ezigbo mbọ n'Afrịka ma nyekwa ọtụtụ ndị Afrịka ohere"". Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46493426,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46493426,Electoral Act: Buhari na-eme ihe PDP mere na 2015 - Dr Mcginger,"Ka o si kwụrụ ugbua, iwu ọhụru nke akpọrọ ""Electoral Act Amendment Bill"" na Bekee agaghị abụ iwu ga-ejikọ ntuliaka Naịjirịa n'afọ 2019.","Nke a bụ makana Onyeisiala Muhammadu Buhari nyeahachịrị ya ndị omeiwu na-ebinyeghi aka na ya. Nke a bụ ugboro anọ Buhri jụrụ ibinye aka n'iwu a. Buhari sị na ihe mere ya ejighi binye aka n'iwu a bụ maka na onwere ebe edochaghị ya anya etu ndi omeiwu si dee ya bụ iwu. Ọ gakwara n'ihu kwuo na e me iwu a ugbua, na ọ ga-enye nsogbu makana ntuliaka nke 2019 adịla nso, nke mere na onwereike gbagwojuo ndị mmadụ anya. N'agbanyeghi ihe Buhari kwuru maka ihe mere o ji mee ihe a, ọtụtụ mmadụ sị na ọ bụghị ezi obi ka o ji mee ihe a. Otu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ihe na-eme n'obodo bụ Dọkinta Mcginer Ibeneme gwara BBC na ihe Buhari mere gosiri na ọ chọghị ime ntuliaka nke 2019 etu ziri ezi. Dọnkinta Ibeneme gakwara n'ihu kwuo na ụdịrị ihe a Buhari na pati ya bụ APC na-eme ugbua bụ ụdịrị ihe PDP mere na ntuliaka nke 2015. Gee Ibeneme ntị ebe a. Ihe Dr Ibeneme gwara BBC maka 'Electoral Act' N'otu okwu ahụ, ọnu na-ekwuru APC na Legọs Steeti bụ Joe Igbokwe gwara BBC na obi Buhari dị ọcha mgbe ọ jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ iwu a. Igbokwe sị na onwere ihe Onyeisiala hụrụ n'iwu ahụ mere o jiri sị ka edegharịa ya. Ọ gakwara n'ihu katọọ PDP, si na ndị mmadụ ekwesighi ige ha ntị. Lee ihe okwuru. Ihe Joe Igbokwe kwuru maka 'Electoral Act' Akụkọ ka na-abịa." afirika-50593781,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50593781,Border Closure: Lee ihe nri na-ada n'ahịa ugbua,Ụmụ afọ Naijiria na-eti mkpu dịka ọnụ ahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe oriri rịrị elu ọjị dịka gọọmenti etiti mechiri agbata Naijiria na mba ndị ọzọ ebe ahịa ndị a si abata.,"Ihe oriri dịka osikapa, mmanụ ọpapa, anụ ọkụkọ na ngwa e ji esi nri dịka tomato n'adazị ọnụ ugbua n'ahịa karịa etu ọ dị na mbụ. Gọọmenti onyeisiala Naijiria bụ Muhammad Buhari ekwuru n'ezie na mmechi e mechiri agbata Naijiria na mba dị ọzọ butere ihe ịda oke ọnụ. Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border'' Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed bụ onye kwuru nke a ka e nwechara ọgbakọ ndị imezi gọọmenti etiti a kpọrọ FEC n'aha ịchafụ na nso nso a. Lee ọnụ ahịa ụfọdụ ihe oriri tupu emechie ụzọ na ugbua e mechiri ụzọ: Osikapa A na-ere otu osikapa ihe dịka puku naira iri na atọ rue puku naira iri na ise (N13,000-N15,000). Mana ugbua e mechiri ụzọ, akpa osikapa na-adazi puku naira iri abụọ na-asatọ. Ndị na-ere osikapa kwuru na ụfọdụ ha anaghị ahụ osikapa ha ga-azụta n'aka ndị na-akọ ugbo osikapa na Naijiria. Anụ ọkụkọ Tupu gọọmenti emechie ụzọ, a na-ere anụ ọkụkọ 'fridge' otu puku naira(N1000) maka otu kilo na Legọs. Mana ugbua, ihe anụ ọkụkọ e tinyere na 'fridge' na-ada bụ otu puku, narị anọ(N1400). Tomato Tomato sokwa n'ihe ndị ọnụ ahịa ha rịrị maka mmechi agbatta Naijiria na mba ndị ọzọ. Iji maa atụ, e reburu otu kilo tomato N6500 ma ugbua ọ bụzị N8070. Mmanụ ọpapa Mmanụ ọpapa na-adabu puku naira itoolu na narị ise(9,500) tupu gọọmenti emechie agbata Naijiria na ndị mba ọzọ. Ugbua, ọnụ ahịa mmanụ ọpapa bụzị puku narị naira iri na otu (11,000). Azụ friji A na-ahụbu azụ friji dịka nri ndị ogbenye Ihe azụ friji na-ada tupu e mechie ụzọ bụ otu puku maka otu kilo. Mana ugbua, ọnụ ahịa ya arịruola otu puku , nari naira abụọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-55872459,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55872459,Igbo Culture: Ihe omimi dị n'ichi ọzọ n'ala Igbo,Echichi bụ ihe ejiri mara ndị Igbo na mba ndị ọzọ nọ na Naijirịa.,"Ndị Ọzọ bụ ndị a na-akwanyere oke ugwu n'ala Igbo Okammụta Chigozie Nnabuihe, bụ onye nkuzi gbasara asụsụ Igbo na Mahadum nke dị na Legọs steeti gwara BBC Igbo ihe onye igbo ọbụla kwesiri ịma maka ichi echichi n'ala Igbo. Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ọbụghị ebe niile n'ala Igbo na-echi echichi ọzọ. Lee etu Ọkammụta Chigozie Nnabuihe siri saa ajụjụ anyị jụrụ ya maka ichi echichi n'ala Igbo oge gboo. Chigozie Nnabuihe kọwara na ọtụtụ ihe agbanweela etu e si echi echichi oge gboo na etu ihe dị ugbu a, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo Kedụ ihe a na-ele anya tupu echie mmadụ Ọzọ? Chigozie Nnabuihe kwuru na e nwere ụfọdụ ihe a na-ele anya tupu echie mmadụ echichi n'ala Igbo nke gụnyere : Kedụ usoro eji echi ọzọ? ""Onye chọrọ ichi ọzọ ga agakwuru ndị chirila ọzọ were gwa ha na ya chọrọ ichi ọzọ"", dịka Nnabuihe siri kọwaa. Lee emume ịwa akwa ndị Obowo Nnabuihe kọwara na ugbua, ndị ọzọ ga-enye ya oge ka ha were lezie anya mara ma ọ na-ekwu eziokwu ma nwee kwa ezigbo agwa. Ọ bụrụ na ihe ha hụrụ juru ha afọ, ha agwazie ya ihe ọ ga-eme were chie ọzọ. Gịnị bụ ịsa ire? Chigozie Nnabuihe kwuru sị, "" mgbe mmadụ mechara ihe ndị ọzọ gwara ya mee ka ọ bụrụ ọzọ, nke ikpeazụ bụ Isa ire"". Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ịsa ire bụ emume nke bụ emechaa ya, onye ọzọ agaghị eji ọnụ ya sia asị na ndụ ya niile. E nwere njirimara ndị ọzọ? Nnabuihe kwuru sị na enwere njirimara atọ kachasị eji mara ndị ọzọ, nke bụ : Okpu mee sọ n'otu ihe eji amara ndị nze n'ala Igbo Kedụ ihe onye chiri ọzọ na-asọ nsọ? Nnabuihe gụpụtara ihe ọnye chịrị ọzọ agaghị eme, ha gụnyere Onye chiri ọzọ agaghị asị asị, nara ngarị maọbụ kpee ikpe ụgha Onye chiri ọzọ agaghị aga njem hie na mba ọzọ Onye ọzọ na nwunye ya maọbụ nwaanyị ọzọ anaghị akpa nkata n'ehihe Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị Onye chiri ọzọ ekwesịghị ịnwụ na mba ọzọ, onye ọzọ nwụrụ na mba nwụrụ ọnwụ ọjọọ. Onye nze anaghị ebu ihe n'isi. Kọwara anyị etu e si eli onye ọzọ? ""Anaghị asị na onye ọzọ anwụọla kama a na-ekwu na eriri onye ọzọ adọbiela"", dịka Nnabuihe siri kọwaa. O kwukwara na anaghị eli onye ọzọ n'akpati ogolog dịka esi eli onye nkịtị. 'N'omenala Igbo, mmọnwu abụghị maka nwaanyị' Nnabuihe kwukwara na onye ọzọ agaghị agba eriri ọzọ ya n'ụkwụ e were lie ya. O kwuru sị, "" Omenala emere mgbe a na-etinye ya eriri a n'ụkwụ, ka a ga-emekwa ma achọrọ ịwepụ ya"". O kwukwara na onye ọzọ ga-anọ n'oche ọzo ya e lie ya. Ụmụnwaanyị a na-echi echichi n'ala Igbo? Nwaanyị chiri echichi na ụmụnwoke chikwara echichi. Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị eee, na e nwere ụfọdụ ebe na-echi ụmụnwaanyị echichi n'ala Igbo Ọ mara atụ sị obodo dịka Umuhu Okabia nke dị n'okpuruọchịchị Ọsụ nke Imo steeti na-echi ụmụnwaanyị ha Lọlọ. Ọkammụta Joy Ngozi Ezeilo mgbe echiri ya echichi O kwuru sị, "" ha na-akpọ onye ha Ndụm Lọlọ n'obodo Unuhu Okabia ebe ụfọdụ ebe n'Anambra steti na-echi ụmụnwaanyị ha Ịyọm"". Kama ọ kowakwara na mpaghara ala Igbo dị iche iche nwekwara nke ha na-echi. Ufọdụ ndị chiri echichi n'ala Igbo na ihe mere ha jiri chie ya Lee ndị Igbo chiri echichi n'obodo dị iche iche na ihe kpatara ha jiri chie echichi: 'Ifekaego nke Nnewi' Ọkaibe ma bụrụ kwa onye zọburu ọkwa onyeisiala mba Naijirịa bụ Kingsley Moghalụ bụ kwa nwaafọ Igbo ọzọ ama ama chiri echichi. Aha a na-etu ya bụ 'Ife Ka Ego' nke Nnewi. Ya bụ aha pụtara onye maọbụ ihe karịrị ego. Ihe mere e jiri chie ya echichi O kwuru na ọ bụ ugwu pụrụ iche ka Igwe nnwei bụ Igwe K.O.N Orizu nke atọ kwanyere ya. O kwukwara na ya bụ echichi dịịrị ya oke mkpa n'ihi na o gosiri na ịkwụba aka ọtụ na ime ihe ziri ezi dị mkpa maka ọdịmma obodo. O kwuru sị, "" Echichi a ga-agba m ume iji gbasie mbọ ike n'ịrụ ezigbo ọrụ m na-arụ"". 'Chinyeluife nke Nimo' Okaibe bụ Tobe Obiefuna bụ odogwu n'ụdị nke ya. Aha ntu ya bụ 'Chinyeluife'. O kwuru sị, "" Aha a na-etu m bụ Chinyelụife n'ihi na Chukwu nyere m akọnuche, onwe m zuru m ma Chineke zara m ekpere m niile"". Ihe mere e jiri chie ya echichi Obiefuba zara sị, "" Nke a bụ omenala anyị, ọ na-enye kwa anyị ohere inyere obodo anyị aka ma hụ kwa na echekwara obodo nke ọma"". 'Kpakpando mbụ nke ọhụhụ' Igbo kwuru na ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya, Iheanyi Igboanụlam bụ dimkpa n'ezie. A na-etu yakpakpando nke mbụ nke obodo Ọhụhụ. Iheanyi Igboanulam na Ezinụlọ ya mgbe echiri ya echichi Ọ bụ Gwurugwuru Eze Innocent Adiele Nwaigwe, Ike Oha abụọ nke Okaiuga-Alike chiri Igboanulam echichi a. Igboanulam bụkwa onye ndụmọdụ nke pụrụiche nke Gọvanọ Abia steeti maka ihe gbasara ịkpata ego na Abia steeti. Ihe mere e jiri chie ya echichi Igboanulam kwuru sị, "" Oge a bụ oge a na-arụ ọrụ impebi obodo anyị, echiri m echichi nke ga-agba m ume dịka onye na-arụ ọrụ imepe obodo ọhụhụ"". Ọ kọwakwara sị,"" Ihe ọzọ echichie pụtara bụ a ga-eji ịkwụba aka ọtọ were mara m oge niile na n'ihe niile m na eme""." afirika-43927857,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43927857,Simi bụ nwaanyị a kachasị họpụta na nrite Headies nke afọ a,Oge itulu ugo nke Headies abịala ọzọ na ngalaba iti egwu na Naịjirịa.,"Simi bụ nwaayị turu ugo di iche iche na ngalaba iti egwu na Naịjirịa Na ntụlị ugo akpọrọ Headies nke afọ a, onye oti egwu Simi bụ nwaanyị ha kachasị họpụta n'ọsọ ịchọpụta onye kachasị tie egwu n'afọ a. Headies họpụtara Simi ugboro isi na ntụlị ugo dị icheiche dịka onye egwu ya kachasị ụtọ n'afọ a (Joromi), onye kachasị eti egwu gbasara ihunaanya (Smile for me), egwu mmadụ abụọ gụrụ (No Forget ft Adekunlu Gold), onye olu ya kachasị dị ụtọ (Gone for Good), onye egwu nchịkọta ya kachasị dị utọ (Simisola), na onye kachasị eti egwu n'afọ a. Ihe mere akụkọ a jiri tụ n'anya bụ makana n'afọ ole n'ole garaaga, ọ bụ ndị oti egwu dịka Tiwa Savage na Yemi Alade bụ ndị a kachasị a họpụta n'ọsọ a dịka ndị kachasị etị egwu n'ime ndị ụmụnwanyị. Oge BBC na Simi nwere mkparịta ụka taa, Simi kwuru na mbọ ya niile bụ maka ị sọ na ndị ha ga turu ugo na emume dịka Headies. N'ọnụ okwu ya: ""udi ihe a bụ ihe mere ka m na-etinye obi m niile n'egwu niile m na-eti"" Ndị oti egwu ndị ọzọ a họpụtara n´osọ ntụlị ugo a bụ Davido, a họpụtara ya ugboro isi, Headies họpụtakwara Wizkid na Olamide ugboro ise. Ha ga-eme ntụlị ugo a n'ụbọchị ise n'ime ọnwa Mee n'afọ a. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-46427166,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46427166,Ballon d'Or: Luka Modric anarala Messi na Ronaldo ụra,Onye otu Real Madrid nakwa onye na-agba n'etiti otu egwuregwu Croatia bụ Luka Modric etụrụla ugo Ballon D'or nke afọ 2018.,"Luka Modric na-agbara otu Real Madrid bọọlụ Modric bụ onye nke mbụ ritegoro nturugo a kamgbe afọ iri Lionel Messi maọbụ Cristiano Ronaldo ritewerela ya. Modric dị afọ iri atọ na atọ ritere nturu ugo nke Champion League nke ugboro atọ n'ahịrị tupu onyere Croatia aka mabute iko mba ụwa nke mbụ ha. Nke a bụ nke mbụ Luka na-etụrụ ugo a kamgbe afọ iri Ronaldo na Messi na-erite ya. N'afọ 2007, ọ bụ onye otu egwuregwu Brazil mabụrụkwa onye na-agbara AC Milan akpọrọ Kaka turu ya bụ ugo karịa Messi maọbụ Ronaldo. Ronaldo onye nke batara otu egwuregwu Juventus sị Real Madrid n'ọkọchị gbara onye nke abụọ n'afọ ahụ. Messi onye na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Barcelona gbara onye ise, ebe Antoine Griezmann (onye otu Atletico Madrid) nakwa Kylian Mbappe ( PSG) ma bụrụkwa ndị ritere France iko mba ụwa gbara onye nke atọ na anọ otu aka ahụ. Kylian Mbappe gbara onye nke anọ na ya bụ nturuugo Mmadụ iri mbụ meriri na Ballon d'Or 2018 1. Luka Modric (Real Madrid and Croatia) 2. Cristiano Ronaldo (Juventus and Portugal) 3. Antoine Griezmann (Atletico Madrid and France) 4. Kylian Mbappe (Paris St-Germain and France) 5. Lionel Messi (Barcelona and Argentina) 6. Mohamed Salah (Liverpool and Egypt) 7. Raphael Varane (Real Madrid and France) 8. Eden Hazard (Chelsea and Belgium) 9. Kevin de Bruyne (Manchester City and Belgium) 10. Harry Kane (Tottenham and England) Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47664851,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47664851,Osun Election: Ụlọikpe enyela Adeleke mmeri,Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka nke kwara ọnọdụ n'Abuja Ekwouola na ọ bụ Ademola Adeleke onye fere ọkọlọtọ pati PDP nwere mmeri na ntuliaka Osun steeti e mere n'afọ 2018.,"Ademola Adeleke zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018 Adeleke na PDP gbara akwụkwọ rịọ ụlọikpe ahụ ka ha kpọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka e mere n'ọsụn steeti dịka one onye nwetara vootu kachasị na ntuliaka ahụ. Mana Oyetola na pati ya tinyere akwụkwọ na-ekwu na mkpesa Adeleke achịtaghị aja ma kwukwa na ụlọikpe ahụ emeghị ikike ịnụ ikpe ahụ. Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke zọkọra ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2019 Mana ka ọ dị ugbua, ụlọikpe a kpọpụtala ya dịka onye meriri ma gwa Inec ka ha napụta Gboyega Adeleke nke APC asambodo mmeri e nyeburu ya. Otiegwu Davido ekelela ndị Osun steeti maka mkpebi ụlọikpe n'okwu nwanne nna ya bụ Adeleke. Davido onye kwupụtara nke a na igwe Twitter yakwuru n'asụsụ Yoroba nakwa bekee' 'Ihe abịala! Ekelee kele ndị Osun steeti."" BBC agbarụọla ihu na mwakpo ndị ọrụ ya Toyosi Ogunseye bụ onyeisi nke mbụ Ọdịda Anyanwụ mba Afrịka nke nta akụkọ BBC BBC agbarụọla ihu na mwakpo awakporo ndị ọrụ ya abụọ n'oge ntulaiaka a gara aga ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla mere nke a ga-echere ha aka mgba. Onyeisi ụlọọrụ ha na mpaghara West Africa bụ Toyosi Ogunseye kwuru na BBC e meela mkpesa n'aka ụweojii banyere nke a. N'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Febụwarị nwaanyị uweojii na mmadụ abụọ ọzọ wakporo onye ntaakụkọ BBC bụ Dooshima Abu n'oge ọ na-arụ ọrụ n'ihu ụlọ gọọmentị ndị Benue Steeti. Ọzọ bụrụ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị onye BBC ọzọ bụ Ajoke Ulohotse, ka otu onye ndọrọ ndọrọ akpọrọ Segun Adewale n'ụzọ si Legọs gawa Abeokuta dịka ọ nọ n'ọrụ ntuliaka. Ntuliaka ndị Inec Ndị otu PDP na ndị patị ndị ọzọ nọ n' ụlọ nta omeiwu na-esi ọwụ ka emegharia usoro ntuliaka ọchịchị na Naịjirịa Inec ekwupụtala echi bụ Satọde dịka ụbọchị ha ga- emegharị ntuliaka fọrọ afọ n'ebe ndị enwere ọgbaaghara n'ihe karịri steeti iri na isii na Naịjirịa. Kọmishọna mgbasa ozi Inec bụ Festus Okoye kwuru nke a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja, ma kwuo na aga-amalite ịgụ vootu na Rivas steeti n'abalị atọ ọnwa Eprelu. Anwụchiela ndị ntọrị n'Enugwu Ndị uweojii na-enyọ na ha bụ ntọ na-akpa mkpamkpa n'Enugwu steeti Ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela ndị ntọrị asaa na-akpa ike n'Enugwu. Mana ha ka na-achọ ndị nke gburu ụkọchukwu bụ Fada Clement Ugwu. Nkewa akarịala na Naịjirịa - Obasanjo Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etile mkpu na nkewa dị na Naịjirịa ugbua a karịa nke dị n'oge agha. O tiri mkpu a n'Abeokuta ụbọchị bụ Tọzde n'ọgbakọ ndị isi ụlọakụ na ndị ọrụ nyocha akụnaụba bụ Association of Chief Audit Executives of Banks in Nigeria na bekee mere. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donlad Trump ekwuola na oge eruola mgbe a ga-anabta Golan Heights dịka ala mba Izrel. Ala ahụ bụ nke Izrel napụtara Sirịa mgbe ha lụrụ agha n'afọ 1967 ka nọ n'isiokwu kemgbe ahụ. Ebe mba Sirịa akatọọla okwu a Donald Trump ma kpọọ ya okwu na-abaghị uru ma ncha. Nyocha ụgbọelu Boeing 737 max Ụgbọala ahụ kpọkasịrị ka ọ bere oge o ji felie elu gafere Nyocha ka na-aga n'ihu n'ihe kpatara ụgbọelu Etiopịa Beeing 737 max jiri kpọkasịa. Ụlọọrụ FAA na mba Amerịka wepụtara ozi na a ga-akụziri ndị ọkwọ ụgbọelu teknụzụ eji ọkwa ụgbọelu ahụ n'ọwa Epurel. Mana ndị ụlọọrụ ụgbọelu Etiopịa kwuru na ndị ọkwọ ụgbọelu ha niile a natala ọzụzụ teknụzụ a tupu akụkọ ahụ na-apụta. N'egwuregwu Onyeisi otu egwu bọọlụ Seychelles bú Gavin Jeanne ekwuola na asọmpi ha na ndị Super Eagles nke Naịjirịa taa bụ Fraide ga-adị ka ebe e ji eze eti akị. Super Eagles ga-ezute Seychelles n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba Delta Steeti n'asọmpi ikpeazụ itozuoke n'Iko mba Afrịka. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga" afirika-47292318,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47292318,Ebonyi Fire: PDP na APC na-arụrịta onwe ha aka,"Ọkụ gbara ihe ruru ụlọ iri atọ n'obodo Nwofe nke dị n'okpuruọchịchị Izzi, n'Ebọnyị state ụbọchị Monde bụ Febrụwarị 18, 2019.","Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na APC na-arụrita onwe ha aka n'ọdachi. Mana ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na o dochabeghi anya ndị mere ihe a. Otu onye uweojii nọ n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abakaliki achọghị ka a kpọọ aha ya n'ihi na ọ bụghị ọrụ ya ịgwa ọha okwu, gwara BBC Igbo na ha amabeghi ma ọkụ ọgbụgba ahụ o metụtara nsogbu dị n'etiti obodo na obodo, ka ọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na ndị obodo ebe ihe a mere na-enwe mkparịtaụka ịmata ebe ya bụ mmiri si banye opi ụgbọghụrụ. Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi, ga-eme njem nleta ebe ahụ ụbọchị taa bụ Tuzde, Febrụwarị 19,2019. Anyi ga-ewetara gị ka o si mee n'uju. Akụkọ ga-amasị gị: Akụkọ ka na-abịa" afirika-43376174,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43376174,Ụtụ anwụrụ na mmanya na-aba n'anya etinyela ego,Gọọmenti Naịjirịa amala ọkwa na ha ga-etinye ego n'ụtụego anwụrụ na mmanya ike.,"Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse aṅụrụ na Naịjirịa Mịnịsịta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun kwuru na nke a bụ iji nwetakwuo ego nye gọọmenti ma belata nsogbu ahụike ihe ndị ha na-akpata. Ntinye ego a pụtara na otu osisi aṅụrụ maọbụ otu sentilita mmanya ọkụ etinyela ego rue pasentị isii ụtụ. Ego a ga-emetụta mmanya biya na stawụtụ, wayịnị na mmanya ọkụ mana enyela ndị ahịa na ndị na-ere ere ohere rue mkpụrụ ụbọchị iri itoolu tupu ụtụ a ebido. Gọọmenti ekwuola na ọ ga-ebido ụtụ nwayọ nwayọ bido n'afọ 2018 rue afọ 2020. Ndị ihe metụtara ekwubeghi ihe ọbụla banyere ọkwa a mana akụkọ na-ekwu na ihe ruru mmadụ nde na Naịjirịa anaghị anọli ma ha aṅụghị mmanya ike maọbụ anwụrụ. Ebe ọ bụ na Naịjirịa na-enwe nsogbu na akụnaụba ya, gọomenti na-ele anya isi n'ụtụ a nweta ọtụtụ ego na dola bido n'ọnwa Juunu afọ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45782796,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45782796,'Rochas emerighi ntuliaka APC Imo West',"Ebilimmiri chịcha obodo, osimiri edere jụụ, mana ebilimmiri Imo steeti ajụla ịdajụụ.","Mike Ahamba (SAN) bụ ndị mbụ sị APC gafee PDP mgbe chị ka bụ ụtụtụ Kemgbe a malitere ndọrọndọrọ imeụlọ APC n'Imo steeti, o doghị anya ihe ọnọdụ steetị ahụ ga-abụ n'ọdịnihu. Kemgbe ụbọchị asaa nke ọnwa asatọ n'afọ 2018 ka aha Rochas Okorocha gbara na akwụkwọ akụ dị ka onye ga-ebuliri APC ọkọrọta ha na ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara Imo West. Obi adịghị ọtụtụ ndị Imo steeti anyị gbara ajụjụọnụ mma maka mpụtara ya bụ ntuliaka. Ichie Mbanaso bụ onye ruburu ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ Imo steeti maka mmepe ahịa sịrị mpụtara ahụ jụrụ akwụkwọ akụkọ maka Okorocha imeri ya ""bụ ntuliaka imeọlụ bụ asị"". Ọ kọwara BBC Igbo ebe mmiri sị baa na ya bụ opi ụgbụghụrụ. Rochas emerighị ntuliaka APC Imo West N'otu aka ahụ Oriakụ Mgbechi Onyekachi kwuru n'ụwa gbara ndị APC gharị n'Imo steeti ugbua. Ọ sị na ""o nweghị onye mazị ebe a kwụ akwụ"". N'uche ya, ""Rochas emeghị ihe ekwekọrịtara na mbụ"". Gee ya ntị na olu. Rochas emerighị ntuliaka APC Imo West BBC Igbo kpọtụkwara onye ọkaiwu dị elu bụ onye so na pati PDP maka ihe na-akpọtụ na Owerri. Mike Ahamba (SAN) sị na ihe mgbawa obị na-eme na APC nke agaghị ekwe ya odidi. Ahamba so na ndị mbụ sị APC gbafere na PDP. Gee ya ntị n'olu. Obi adighị ọtụ mmadụ mma maka ihe pụtara na ndọrọdọrọ APC Imo Onye ndụmọdụ onyeisi PDP bụ Ike Ebonyi sị na ndị Imo ga-akwụsili ihe na-eme n'Imo ma ọbụrụ ha kwụsị ịla aka azụ. Okwukwara na megharị a na-emegharị ntuliaka APC n'Imo steeti gosiri n'aka azụ dị na ya. Ọ sịkwa na ime na anyị ndị Imo otu a na ndọrọndọro ọchịchị maka ha anaghị akwanyere otu esi eke ọchịchị na mpaghara na mpaghara ugwu dị ka ndị Steeti ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46938767,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46938767,2019 Elections: Leekwa ihe ị ga-eme ka a ghara ịgụpụ vootu gị,Ngalaba na-ahụ maka ntụlịaka na Naịjirịa niile esila n'ọnụ Mazi Abuonum Ufenne kọwa ihe ga-eme ka akagbuo vootu gị.,"O dị mkpa ịgee ntị na ihe ndị a ka onye akwụkwọ vootu were baara gị uru na ntuliaka 2019. Lee ụzọ ise ị ga-eji gba mbọ hụ na onweghị ihe mere vootu gị nakwa na-agụnyere ya na vootu ndị ọzọ. 1) Ebinyela aka n'elu ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọbụla Binye ya n'ohere enyere n'akụkụ ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ahụ n'elu akwụkwọ vootu. 2) Edela edemede n'elu akwụkwọ vootu gị Ma aha gị o, ma mkpụrụ edemede, ma akara edemede, edela ihe ọbụla n'elu akwụkwọ vootu. 3) Ejila ihe ọbụla metọ akwụkwọ vootu gị Ọkachasị mmanụ mkpisi odee nke eji eme ntụlịaka, gbaa mbọ hụ na o nweghi ihe iji metọ akwụkwọ vootu gị. 4) Afịkọna akwụkwọ vootu gị Ọ bụrụ na ịfịkọọ akwụkwọ vootu gị, ọ ga-arịa ahụ ịchọpụta etu isi binye aka nke ga-eme na a ga-akagbu ya. 5) Etinyela akwụkwọ vootu gba ọtọ Isi dị na ntụliaka bụ ịhọpụta otu ndọrndọrọ masịrị gị. Ya mere na ịtụnye akwụkwọ vootu gba ọtọọ na agaghị agụnye uche gị na ntụlịaka." afirika-48421394,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48421394,Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ,"O ruola n'omume, onyeisiala Buhari biyela aka Bọjeti 2019.","Onyeisiala Buhari binyere aka na Bọjeti 2019 Bashir Ahmed onye na-enye onyeisiala Buhari aka depụtara akụkọ a n'igwe Twitter ya: End of Twitter post, 1 IPOB bidoro nghaghari iwe ya n'afọ 2012 Ndị otu Ipob ekwuola na ọ bụrụ na ndị ọnụ na-eru n'okwu bidoro n'oge kwuwe maka ịmanye Naịjirịa n'okpukpere chi Alakuba , ihe akarị mebi etu ọ dị ugbua. Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu IPOB kwuru na okwu 'Fulanisation ' aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ okwu Nnamdi Kanu na-ekwuritọ kamgbe. Cheta na Obasanjo kwuru na ọ bụrụ na-eji aka ike wee ibuso ndị omekome akpọrọ Boko Haram na otu ndị ọzọ na-akpa mkpa mkpa na mpụ ha na-eme karị ịbụ akụkọ ochie. Ndị uweojii nọ na Jos ekwuola na ọtụtụ mmadụ nwerike so na ndị nwụrụ anwụ n'ọgbaghara ọhụrụ mere na steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Tyopev kwuru na ndị otu ya agaala na mpaghara ahụ imenyụ ọgụ a dapụtara ụnyahụ na Dutse Uku, Rikkos nakwa Cele Bridge. Ụlọ a na-arụ kamgbe afọ 20 adaala n'Owerri Ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Lagos Island. Dịka ndị Anambra ka na-enyocha ihe kpatara ụlọ ji daa n'Onicha, ụlọ ọzọ adaala n'Owerri mana akụkọ na-ewunu bụ na mmadụ anọ sepụtara isi na ya bụ ihe mberede. N'egwuregwu, Onyeisi otu egwuregwu Manchesyter city bụ Khaldoon Mubarak ekwuola ndị ibe ha na-ewuru ha anyaọkụ maka etu ha si eme nkeọma n'egwuregwu bọọlụ. Cheta na ọ bụ ha bu otu egwuregwu beekee bu ụzọ merie iko eguregwu dị iche iche ugboro atọ dịka ha merichara watford na iko FA ọkpụ goolu isii asataghị otu. N'ofesi, Ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Dr Congo egbuola mmadụ ruru mmadụ iri atọ gụnyere ọtụtụ ndị nkụzi gara ịnata ego ụgwọ ọnwa ha. Ebe ndị omekome gbagburu mmadụ anọ n'ụlọụka Katọlik dị na Burkina Faso mgbe a na-aka ụka Sunday. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Migraine headache: Ihe oke isiọwụwa na-eme n'ụbụrụisi" afirika-53585246,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53585246,Mamman Daura: Okwu ya maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala Buhari- Garba Shehu,Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na okwu Mamman Daura bụ nwa nwanne onyeisiala kwuru maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala.,"Mamman Daura sị na ya na Buhari bụ ahụghị-ma-erighị n'agbanyeghi na (ha abụghị ọgbọ) ọ bụ nwanne nna ya Shehu kwuru sị na ihe Daura kwuru na ọchịchị Naịjirịa kwesịrị ịbụzị onye tozuru etozu karịa na mpaghara etu ọ bụbu, bụ uche Daura. End of Twitter post, 1 Ọ bụ ka ha chịchara ogologo oge ka Daura na-elota 'competence'? - Nnia Nwodo Ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọọla nwa nwanne Onyeisi Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura maka ikwu na agaghị eme ntuliaka onyeisiala n'afọ 2020 na mpaghara o rutere nke Bekee kpọrọ 'zoning.' Ha kwuru na okwu ya nwere ike ibute ọgbaghara ma kposaa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria. Daura nọrọ na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere kwuo na ọ bụghị mpaghara onye si ga-ekwu onye ga-eweghara ọkwa onye ga-achị Naijiria na ntuliaka 2023 kama ọ bụ onye tozuru etozu. Okwu Mamman Daura nwere ike ikposa ọchịchị onyekwuocheya na Naijiria- Nwodo Mana onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kwuru na ""ọ bụ ka ndị si otu mpaghara Naijiria nọcharala ogologo oge n'ọkwa onyeisiala, ka o chetara na e kwesiri inwe ogogo"" onye tozuru etozu ịzọ ọkwa. Nwodo sịrị na okwu ahụ Daura kwuru megidere iwu Naijiria dịka ọ dị n' Akụkụ 14(3) nke Iwu 1999 nke kwuru na gọọmenti etiti kwesiri ka a chịkọta ya n'ụdị na mpaghara ọbụla ga-esonye na ya nke Bekee kpọrọ ""Federal Character,"" iji kwado ịdịkọnotu. Nwodo onye gbara ama na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ 'AIT' were n'abali Wenezde sị, ""Ana m akwanyere Mamman Daura ugwu mana okwu ya gosiri na ọ maghị ihe na-aga n'ọchịchị Naijiria, nke ọ na-akwanyere Onyeisiala onye ya na ya bụ otu ọbara ugwu n'ikwu ụdị okwu a nke nwere ike ikposa Naijiria. Ọ bụ ihe mwute."" Nwodo, onye tụrụ arịrị maka oke a na-awọ ndị Igbo na Naijiria siri na ""ịchọ onye kachasị tozue etozuo na mpaghara a kachasị megbuo n'ala Naijiria nke bụ Ọwụwa-Anyanwụ"" bụ ihe e kwesịrị ime na 2023. O kwuru na mpahara Ọwụwa -Anyanwụ nwere ebu , nwee mfụ na ndị tozuru ịchị Naijiria. 'Mpaghara ndị ọzọ chịchara, o rue oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụrụ na ọ gaghị abụzi na mpaghara na mpaghara?' ""Ọ gaghị abụ oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ, a sị na ọ gaghị abụzi 'zoning'"" N'otu aka ahụ, Okechukwu C Obioha bụ onye nchịkọta otu 'Southeast for President 2023' bụ SEFORP2023 n'aha ịchafụ kwuru na okwu Mamman Daura kwuru goziri na "" ọ chọkwaghị ọganihu Naijiria."" "" Onye ahụ na-ekwu ụdị okwu ahụ, ọ nọghị na Naijiria. Ọ ga-abụ ugbua mpaghara ndị ọzọ chịchara, o rue oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ ọ bụrụ na ọ gaghị abụzi na mpaghara na mpaghara?"" Obioha jụrụ ajụjụ sị, ọ bụrụ na ọ bụghị na mpaghara, na mpaghara, gịnị mere ndị mpaghara Ugwu ji sie ọnwụ na Goodluck Jonathan agaghị abịa nke agba nke abụọ ya? Ọ gara n'ihu kwuo sị, ""Okwu ya gosiri na ọ bụghị onye ihe na-aga n'a Naijiria doro anya."" ""E were m ya na ọ bụ na o si n'ụra tete. Onye ọbụla kwuru ụdị ihe, ikuku Covid-19 ji ya."" Ọchịchị 2023 ga-abụ maka onye tozuru etozu ọ bụghị 'zoning' - Mamman Daura Nwa nwanne Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura ekwuola na ịzọ ọchịchị ọkwa onyeisiala na 2023 agaghị agbado ụkwụ na mpaghara onye si nke Bekee kpọrọ 'zoning' kama ọ ga-abụ ihe onye nwenwuru ike ime. Daura kwuru nke a mkparitaụka ya na BBC Hausa nwere na nsonso a dịka ụfọdụ ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-ekwu na ọkwa ahụ kwesịrị irute ndị si mpaghara ahụ. N'ọsịsa ajụjụ a jụrụ ya maka ihe o chere maka ikenye ọzụzụ onyeisiala afọ 2023, nye otu mpaghara ohere ka ha zọọ, ọ sị: "" Eee, ọ bụ ihe dịrị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ịchọ onye kachasị mma. Anyị anwaleela ike ọchịchị na mpaghara na mpaghara, mana ọ mịtaghị mkpụrụ."" ""Ihe dị oke mkpa bụ na ọ bụ onye kachasị tozuo ma nwekwa ihe achorọ karịa ebe onye si. Oge eruola oge anyị mekọrịtara mara na anyị niile bu otu."" Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ahụta Daura dịka otu onye n'ime ndị Buhari ji ọnụmmiri okwu ha eme ihe, nke Bekee kpọrọ 'Cabal' dịka Abba Kyari na Isa Funtua. Mana oge a jụrụ ya ma ọ na-enye Buhari ndụmodụ, Mamman sị ""Ana m aga ekele ya ma nye ya ndụmọdụ ma ọ jụọ m, mana anaghị m etinye ọnụ n'ihe agbasaghị m n'ihi na ọ bụghị etu gọọmentị si eme."" Mamman Daura sị na ya na Buhari bụ ahụghị-ma-erighị n'agbanyeghi na (ha abụghị ọgbọ) ọ bụ nwanne nna ya Daura, onye kwuru na ya na Buhari tokọrọ ma bụrụ ezi enyi n'agbanyeghị na Buhari bụ nwanne nna ya sị ""Nna m tọrọ Buhari dịka Buhari bụ ọdụdụ nwa nnanna m."" N'okwu mmekọrịta ya na Abba Kyari nakwa Malam Isa Funtua ndị nwụrụ na nsonso, Daura sịrị na ""Ndị ezigbo enyi abụọ akwaala m. Ihe ukwu mere m site n'ọnwụ ha. Ha abụọ bụ ndị ezigbo mmadụ"". Che aka ghọrọ mkparịataụka BBC na Mamman Daura ahụ n'uju ụbọchị Satọde na-abịa. Akụko ndị ga-amasị gị:" afirika-54367469,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54367469,Donald Trump na Melania nwunye ya ebutela coronavirus,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nwunye ya ebutela coronavirus.,"Trump dị afọ 74 kwuru na ya na Melania dị afọ 50 abanyela na nnọpụ iche kwesịrị iru ụbọchị 14, ma kwuo na ha ga-ejikọ aka ọnụ wee gbakee. End of Twitter post, 1 O kwuputere nke a na-erughi awa abụọ Onyeisiala Trump depụtara na Twitter na ya na nwunye ya na-echebiri mpụtara nnyocha e mere ha dịka Hope Hicks bụ onye enyemaka ya pụrụiche, butere ya bụ ọrịa. Hicks dị afọ 31, bụ onye kacha eru Trump nso ọrịa a fesarala. Ya na Trump so mee njem oge ọ gara nrụrịtaụka dị n'etiti ya na Joe Biden, n'Ohio ụbọchị Tuzde. A hụrụ Hicks dịka o si n'ụgbọelu arịtu na-eyighi mkpuchi imi n'ụbọchi Tuzde ahụ. Ya na Trump sokwa n'ime ụgbọelu helikọpta oge ha na-aga ịchụ nta vootu na Minnesota n'ụbọchị Wenezde. Echefula na Trump bụ otu olu siri ike n'ịkatọ ihe gbasara iyi mkpuchi imi maka mgbochi ọrịa Covid-19 kemgbe ọrịa a selitere isi. Chetakwa na ọ fọrọ naanị mkpụrụ ụbọchị 32 tupu e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka nke Trump so azọ. Kedụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya? Kemgbe Trump kwuputere na a chọtara ọrịa a n'ahụ ya, ịntanetị enwurula ọkụ. Ebe ụfọdụ na-emetere ya ebere, ndị ọzọ na-achị ọchị sị na ọ dị mma na ọ metụtara ya. Ndị na-ekweghị na o butela ya bụ ọrịa Rhoma Mcguire kwuru sị na o chechaghị na ọ bụ eziokwu na Trump butere ọrịa a, n'ihi na ""ọ na-atụkarị oke asị"". @murray_nyc kwuru sị na Trump nwereike ị na-atụ asị n'ihi na ọ naghị eme ọfụma na ntuliaka. Ọ jụrụ sị na onye ma ma ọ bụ ụzọ Trump chọrọ isi gbalahụ iso Biden mee nrụrịtaụka ọzọ maọbụ mee ka ndị mmadụ metere ya obi ebere. Charlotte Hill kwuru na Trump na-atụ asị na o butela ọrịa covid-19 a iji gbalahụ ikpe e kwesịrị ikpe ya maka 'mpụ dị iche iche'. Ndị na-emetere ya ebere Mike Pence bụ osote onyeisiala mba Amerịka kwuru sị na ya na nwunye ya na-kpere Trump na nwunye ya ekpere ka ha nwee ike ịgbake. JT Lewis onye na-akwado Trump kwuru sị na ndị mba Amerịka na-ekpere ya na nwunye ya ekpere ma sị na ha chọrọ ka ọ gbakee. Tulsi Gabbard pụtaburu maka ịzọ ọkwa onyeisiala kwuru na ya na di ya na-ekpere Trump na nwunye ya ekpere, ma kwuo na ha na-echetakwa ezinaụlọ ya n'oge dị etu a. Ndị na-achị ya ọchị @aotdts tinyere ihe onyonyo ebe ndị mmadụ na-agba egwu wee sị na ọ bụ etu ọrịa covid-19 si banye n'ahụ Trump ka ọ kwuchara na ọrịa a adịghị ire. Jennifer Lavallee kwuru na ọ bụ ya ji isi ya kote ebu gbara ya. @Cleavon_MD kwuru sị na ọ naghị ewute ya ma ncha na Trump butere ọrịa a, n'ihi na ọ bụ ""maka ya"" ka ọrịa a ji gbuo ndị ọrụ ahụike ibe ya atọ nakwa otu nwanne ya. Akụkọ ka na-abịa." 43055088,https://www.bbc.com/igbo/43055088,Ụkọchukwu n'Enugu na-ahazị nzukọ mekọahụ n'ụlọụka ya,Ihe n'ewu na nta akụkọ ọhụrụ a na-akpọ social media bụ ihe ụlọụka dị n'Enugu na-akwado ime na 18 Febụwarị.,"Vincent Nzeakor bu ụkọchukwu na'ụlọuka Wordcity Assembly di n'Enugu. Ụlọụka akpọrọ Wordcity Assembly, nke ụkọchukwu Vincent Nzeakọr bu onye ndụ ha na akwado ime nnukwu nzukọ ebe ha ga ekwu okwu banyere mekọrịta nwoke na nwaanyi. Ihe mere ihe a jiri tụọ ndị mmadụ n'anya bụ maka okwu mmekorita nwoke na nwaanyi bụ ihe anaghị ekwusi ike. Ma na ụka, ma na ezinụlọ, okwu mmekọrịta nwoke na nwaanyi abughị ihe ndị ala anyị na ekwụsị ike. BBC Igbo gbara Nzeakọr ajụjụ maka nke a, o kwuru si na ihe ha na-eme bụ ihe ziri ezi maka o si na akwụkwọ nso ndị ụka bia. Gee nu ya ntị ebe a. Vincent Nzeakor kwuru maka nzukọ mekọrịta nwoke na nwaanyị ọ ga eme Nzeakor na-akọwa na ya mara iwu banyere nzukọ a ụka ya ga eme, sị na ọ bụ sọọnsọ ndị mebụrụ alụm di na nwụnye na ndị rụrụ afọ 25 ka a ga anabata. Nzeakor kwuru, ""Ị ma, ndị mmadụ na ekwu na okenya na-ebido na afọ 18, mana ekweghị m na nke ahụ, ọkacha na ụdịrị nzụkọ a anyị ga-eme. Ya mere anyi jiri tinye ya etu a. Ka anyi mara na onye ọbụla na abịa abụrụla ezigbo okenya."" Ọ gara n'ihu gwa BBC na etu a na-asi na ụka ekwesịghị ịtinye ọnụ na ihe gbasara mekọrịta nwoke na nwaanyị so n'ihe bụ nsogbu uka sikwa na ""ọ ya na ebute mpụ na ajọ ihe ndị ọzọ"". Ge ya ntị ebe a. Ụkọchukwu kwuru okwu maka mekọrịta BBC Igbo gara n'iru jụọ ya ebe o si weta ikike o ji na eme ụrịri nzụkọ a, o wee sị na o na akwụkwọ nsọ. Na Facebook, ndị mmadụ na eti mkpu maka ihe a. O nwere ndị na-akọwakwa na-ọbụghị so Nzeakọr na eme ụdiri nzụkọ a, ma na enyekwa atụ, dika nke di na ala: Nzeakor na onwe ya si na ya kwusi ike na ikike ọ sị n'akwụkwọ nsọ nyere ya." afirika-54034614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54034614,Ị kwesịrị ịsụcha 'Pubic Hair' gị?,"Onweghi onye okorobịa maọbụ agbọghọ na-enweghị ""ọhịa"" ""n'adazianị"". Ihe dị mkpa bụ ka i si abọcha maọbụ ebu ya bụ ""ọhịa"".","Ọtụtụ mmadụ kwenyere na ịkpụ ajị mgbada na-adị mma, ụfodụ sị na ọ ka mma iruwe ya. Kedụ nke bụ eziokwu? Taa ka anyị ga-ama nke bụ nke. Ọ na-adịrị anyị mfe ikwu maka ajị ihu maọbụ aji ahụ ndị ọzọ, mana o ruo n'ajị ọtụ maọbụ aji amụ, ọnụ amawa anyị ririri. Ọ ga-abụ ya mere muchi muchi jiri karịa n'okwu gbasara aji ọtụ na ajị amụ. Mana taa anyị ga-agba ya n'anwụ ịmata ihe zoro ezo n'okpuru anyanwụ n'okwu ajị ""adaziani"" n'etiti nwoke na nwannyi. Nchọpụta e mere na mba Amerịka na-egosi na ịkpụ ajị a abụghị naani ihe Naịjirịa, kama na mba Amerịka, n'ihe karịrị ụmụnwaanyị pasent iri asatọ na-akpụ ajị mgbada ha, ebe pasent iri ise n'ụmụnwoke na-akpụkwa nke ha. Dịka nchọcha ha mere n'afọ 2017 siri kwuo, ọtụtụ mmadụ ruru 15% na-emerukwa onwe ha ahụ be ha edozi ""adazianị"" nke ụmụnwaanyị ka n'ime ha. Valentine Udora bụ dọkịnta Bekee n'ụlọọgwụ UNTH Enugwu sị na mmadụ asaa maọbụ asatọ n'ime ụmụnwaanyị iri na-abịa nleta n'ụlọọgwụ na-akpụcha aji mgbada ha. Mana dọkịta Udora dokwara anya na e kwesiri ị na-akpachapụ anya mgbe e ji agụba eje na mgbada. Nchọpụta gosiri na imerụ ahụ site ịkpụ ajị mgbada na-akakwa njọ na ndị gbagolitegoro n'afọ. Ọ bụrụ na ha merụọ ahu, ọ na-ara ahụ ịla. Dọkịnta Udora sịkwa na ihe a na-ele anya n'ịkpụ aji bụ, onye ahụ ana akpụcha aji kpam kpam ka ọ na akpufodo. Ọ sị na ebe ọka njọ bụ ịkpucha aji niile dị onye ahụ n'ahụ. O kwuru na o nwere uru aji mgbada bara ọkachasị n'ahụ nwaanyị. Uru ajị mgbada bara:" afirika-55144590,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55144590,World AIDS Day: : Ihe m mere oge m chọpụtara na m bu HIV - James Brown,"James Brown bụ onye ọtụtụ ma ama na Naịjirịa dịka nwoke na-eyi akwa nwaanyị, nke Bekee kpọrọ 'Cross Dresser'.","Ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọtahie Brown n'ihi etu o si ebi ndụ ya ma na-emekwa dịka nwaanyị. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'afọ 2018, ọ kọrọ akụkọ etu o si chọpụta na ya nwere ọrịa HIV/AIDS. Brown kwuru na ọ bụ site n'afọ nne ya ka o si bute nje a, mana nna ya mere ka ọ mara nke a oge ọ dị afọ iri na abụọ. Mana na-agbanyeghị ọrịa ahụ, Brown kwuru na ọ na-ebi ndụ ya nke ọma na-enweghị nsogbu ọbụla. O kwukwara na HIV/AIDS abụghị ngwụcha ndụ. Ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba afọ ọbụla bụ ụbọchị e wepụtara maka ọrịa HIV/AIDS. Ọ bụ ụbọchị e ji akụzi maka ya bụ ọrịa, etu mmadụ ga-esi zeere ibute ya, nakwa etu ndị bu ya nwere ike i si bie ndụ ha nke ọma." afirika-44949159,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44949159,Ihe Buhari kwuru maka ndị si APC pụọ,Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru sị na otu APC ka ga-akwụsị ike n'agbanyeghị na ndị omeiwu ruru 40 si na ya pụọ ụnyaahụ.,"O kwukwara na APC anwaala ike ha ịkwụsị ọpụpụ ndị a, ma jaa ndị isi APC mma maka mbọ ha na-agba maka ndịnotu pati a nakwa ""mmeri dị n'ihu"". N'ozi Buhari depụtara na Facebook ya, o kwukwara sị ka ndị na-akwado APC ghara ịtụ ụjọ, maka na ụdịrị ọpụpụ a bụ ihe a na-ahụ tupu e mee ntuliaka. Content is not available End of Facebook post, 1 Onụ na-ekwuchitere Buhari n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuru na Onyeisiala Buhari ebughị ihe ọjọọ n'obi gbasara ndị si APC pụọ. Shehu tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara oku ndị uweojii kpọrọ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ụnyaahụ. O kwuru na gọọmentị etiti ahụla ihe na-eme ma akpọkuo onye ọkwa ya gbalitere. O kwukwara na iwu obodo metụtara onye niile, na-abụghị naanị ndị ogbenye. n'ozi o dere na obodo a agaghị enweta ezigbo ọganiihu ma ọ bụrụ na a na-enyo iwu oge ọbụla a kpokuru onye ọbụla ọkwa ya gbalitere. O kwuru sị na ọrụ ndị nchekwa niile na-etu ha si arụ ya dị n'iwu obodo. Shehu kwuru na Buhari anaghị etinye ọnụ n'ihe gbasara oku ndị ọrụ nchekwa na-akpọ ndị ha na-enyocha. O kwukwara na onye ọbụla a chọtara ihe n'aka ya kwesịrị ịga ụlọikpe zara ọnụ ya, karịa ịgakwuru ọha na-eti na a na-emegbu ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56654501,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56654501,Owerri Prison Break: Ọ dịghị mma etu onyeisi uweojii jiri bo ipob na emeghị nchọpụta - Uwazuruike,"Ralph Uwazuruike nke Massob ekwuola na etu Gọọmenti si so ihe mere n'Owere, Imo steeti, ebe ndị ji egbe wakporo ụlọmkpọrọ tọhapụ ndị e ji eji, ekwesịghị ekwesị.","Ndị ji egbe wakporo ụlọmkpọrọ na ogige ndị uweojii ma tọhapụ ndị nga karịrị otu puku. Lee ọkpụrụkpụ okwu Uwazuruike tụpụtara na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere taa maka ihe merenu: 'O (onyeisi ndị uweojii) kwesịghị ịkpọ aha ganye na e mechaa nchọpụta.' Uwazuruike kwuru na o kwesighị ekwesị ịkpọ aha onye ọbụla ganye ma e mechara nnyocha tọtọ atọ. ""E nwere ntuziaka na a ga-eme nchọpụta ihe mere. Ọ bụghị ihe kwesịrị ịkpọ aha onye ọbụla n' emechaghị nchọpụta"" ""Ọ bụrụgodi na o nwere obi na ọ bụ ndị Ipob, o kwesịghị ikwupụta ya ma ha emebeghị nchọpụta."" 'Ndịiche dị na etu gọọmenti etiti si so ihe mere n'Ebonyi na nke mere n'Owere' Uwazuruike sị, ""Ụbọchị ole gara aga n'Ebonyi steeti e gbusiri mmadụ rinne n'ebe ahụ, mana onyeisi ndị uweojii agaghị ebe ahụ."" ""Mana ụlọmkpọrọ bụ ebe ndị mmadụ anwụghị, onyeisi ndị uweojii agbara gaa ebe ahụ na-erughi awa 24."" ""Ọ rara ahụ ịhụ onyeisi ndị gọọmentị ekwuo okwu."" ""O (Ihe mere) gosiri na enweghị nchedo n'Ala Igbo."" 'Ndị ọrụ nchekwa arụghị ọrụ ka dịka o siri kwesị' Uwazuruike jụrụ ajụjụ sị, ""Kedụ ka ha (DSS) na ndị uweojii siri nọrọ mmadụ karịrị 100 akpaa nkata, ha anụghị maka ya tupu o mee?"" Ọ gara n'ihu sị, ""Ọ bụrụ n'ala ndị ọzọ, onyeisi ndị uweojii kwesịrị itinye akwụkwọ arụkwaghịm."" 'Enweghị ikpenkwụmọtọ butere ọgbaghara' Uwazuruike rụtụrụ aka na ọ bụ enweghị ikpenkwụmọtọ bu na ala adịghị mma. Ọ sịrị, ""Ọ bụ maka obodo adịghị mma ka ụmụaka jiri buru egbe."" ""E mee nwa ka e mere ibe ya, ọgbaghara niile alaa. Enweghị ikpemkwụmọtọ na-ebute ọgbaghara."" Lee ihe o kwuru n'uju ebe a:" afirika-47708405,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47708405,Kaduna state: Gịnị ka ndị ntọ na-achọ n'ahụ ndị Fada?,Ndị oji egbe egbu atọrọla otu Fada akpọrọ John Bako Shekwolo n'obodo Ankuwa dị n'okpuruọchịchị Kachir na Kaduna.,"Ọnụ na-ekwuichitere ndị uweojii bụ Yakụbụ Sabo na Kaduna steeti kwuru na ndị ntọ gara na be Fada Shekwolo na-emeghị mkpọtụ ọ bụla ga-atọrọ ya. Sabo kwuru na ozugbo ihe a mechara ,o zipụrụ ndị otu ya ha chọwa n'akụkụ obodo ahụ niile ka ha mata ebe ndị omekome a kpọ Fada Shekwolo gawa wee gbapụta ya. O kwuru na etu ọ dị ugbua na ha ka na-enyocha ma na-arịọ ndị mmadụ nwereike itụnyere ha azụ gbasara ebe ọ bụ ha bịa n'ụlọọrụ ha gwa ha. Dịka ụlọọrụ mgbaozi punch si depụta, Fada Shekwolo bụ ụkọchukwu ""St. Theresa's Catholic church"" dị n'obodo Ankuwa Ihe ka na-agbagọjụ ndị mmadụ anya bụ etu esi atọzị ndị ụkọchukwu agbanyeghị na ha bụ ndị na-enyere ndị mmadụ aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53620523,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53620523,Hydroxycholoquine: Ihe ị kwesiri ịma maka etu ọgwụ a si metụta covid-19 - Dkt Ije Akunyili,"Dọkịta Ije Akunyili bụ onye na-agwọ ọrịa mberede nke Bekee na-akpọ ""Emergency Medicine"" na mba Amerịka.","Ọ bụ onye na-elekọta ndị na-arịa coronavirus ""n'abalị, n'ụtụtụ nakwa ehihe"", dịka o si kwuo. Dọkịtan Akunyili tinyere ọnụ n'ihe banyere ọgwụ ịba a na-akpọ hydroxychloroquine, Zinc nakwa zithromax, ọkachasị etu ha siri bụrụ ihe ndị eji agwọ covid-19. Dọkịta Akunyili gbadoro ụkwu n'ala kwusie ike na onwebeghị nchọpụta kwadoro atụmatụ iji hydroxychloroquine gwọọ coronavirus. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Zinc na Zithromax abụghị ọgwụ a na-aṅụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ndị dọkịta sị mmadụ ṅụọ ha. ""Nsogbu ha na-enye n'ahu ka ihe a na-erite na ha."" Gee ya ntị ọfụma n'akụkọ a o meere BBC Igbo." media-44583485,https://www.bbc.com/igbo/media-44583485,Ndị uweojii: Anyị na-achọ dọkịta pịara nọọsụ ihe,"Ndị uweojii nọ na Legọs ekwuola na ha na achọ Dọkịta tiri nọọsụ ihe n'ụlọọgwụ, Awoyaya Hospital,dị n' Ibeju Lekki, Legọs.","Akụkọ kwuru na otu dọkịta na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ Dkta Emmanuel Okolo pịara nọọsụ Dorcas Adeyera ihe maka nghọtaghie dapụtara na ịnabata onye nwere mberede okporoụzọ e butere n'ụlọgwụ ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Oti kwuru na ha ""na-achọ"" nwa amadị ahụ. Adeyera boro Dkta Okolo ebubo na ọ sekpubere ya ala, maa ya ụra ugboro ugboro ma pịakwa ya mgbadoukwu(belt) n'ihi na ọ nabatara onye nwere ihe mberede okporoụzọ na anataghị ikike n'aka ya. Nọọsụ ahụ nke degara onyeisi ụlọgwu ahụ ozi mkpesa, gakwara kpesa ya n'ogige ndị uweojii. Ka ọ dị ugbua, mbọ BBC gbara inweta ọnụ okwu dọkịta ahụ amịtabeghị mkpụrụ oge anyị dere anyị bipụtara akụkọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anyị ga-ewetara ụnụ akụkọ ka o si aga." afirika-48633436,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48633436,Child trafficking: Aka ndị uweojii akparala ndị ntọrị ụmụaka n'Imo Steeti,Ndị ngalaba 'Operation Puff Adder' nke uweojii Imo Steeti anwụchiela mmadụ isi ọrụ ha bụ ịtọrị ụmụaka.,"N'ụbọchi 24 nke ọnwa Epurel, 2019, nwaanyị aha ya bụ Immaculata Edward sị na ya dị afọ 31 si obodo Okondo dị na Cros Riva Steeti tọọrọ umụaka ise bi na be enye ya nwoke a kpọrọ Ifara Isong bi na Ngor Okpala dị n'Imo Steeti. Immaculata zuru ụmụaka ise ndị agbataobi enyi ya nwoke ahụ bụ ndị nne na nna ha sịrị ya lekọta ha anya. Ụmụaka a bụ ndị otu nne mụrụ gụnyere; Somto Eke, nwaanyị dị afọ isii, Kelechi Ekeh, nwoke dị afọ ise. Ndị ọzọ bụ Chisom Ekeh, nwaanyị dị afọ atọ, Ebuka Enwerem, nwoke dị afọ atọ, Chioma Enwerem, nwaanyị dị afọ ise na Lucky Ida, nwoke dị afọ isii. Ụmụaka azọpụtara na ezinaụlọ ha Immaculata kpọgara ha n'aka onye ama ama n'ịtụ mgbere ụmụaka bụ Perpetual Iwuji si n'Obokwu Ulakwo, Imo Steeti. Perpetual kpọrọ ụmụaka abụọ n'ime ndị a ma ree ha n'aka Grace Nwachukwu si Aboh Mbaise ma biri na Mpape Abuja. Immaculata zukwara ụmụaka abụọ bụ ụmụ nwanne nna ya si na Cross River Steeti ma ree ha n'aka Ifeoma Ndubuisi si na Lokpanta Abia Steeti. Nwata azọpụtara na nne na nna ya Site na nyocha tara ọchịchị ndị uweojii, a chọtala ụmụaka niile ahụ a tọọrọ ma tinye ha n'aka ezinaụlọ ha. N'ime nyocha ahụ, azọpụtara ụmụaka ise ọzọ n'aka Perpetual Iwuji ma ziga ha n'ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka. Ndị a na-enyo enyo n'aka ha dị na nke a gụnyere Perpetual Iwuji, Isong Ifara, Immaculata Edward, Grace Nwachukwu, Ifeoma Ndubuisi na Stephen Ezenwa. Ịtụ mgbere ụmụaka abụghị ihe amaghị maka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52797637,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52797637,Onitsha Bridge: Gịnị na-akpọtụ na akwa mmiri Niger?,Ọ bụ n'ụbọchị ụka nke Mee iri abụọ anọ ka ụfọdụ ihe onnyonyo nakwa foto gosiri ebe etinyere geeti na mbido akwa mmiri Niger bidoro ịfegharị ebe niile.,"Akụkọ ndị ahụ na-ekwu na gọọmentị Anambra steeti mere nke a iji kwụsịtụ njem ụgbọala nke gọọmentị etiti machiri n'ihi ọrịa coronavirus. Otu onye hụrụ ebe ihe a mere bụ Harrison Gwamnishu gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ n'abalị ụbọchị Satọde ka gọọmentị Anambra tinyere geeti ahụ nke ndị mmadụ hụrụ n'ụtụtụ ụbọchị ụka. O kwukwara na ọtụtụ gwongworo ndị bu nri nakwa mmanụ agbịdị tọrọ atọ n'elu akwa mmiri ahụ n'ihi na ha ahụghị ụzọ ịbata ebe ọbụla. Mana n'iwu gọọmentị etiti manyere, ha kọwara na ụgbọala ndị bu ihe dị mkpa ekwesighi isonye na mmachi amachiri njem. Harrison kwukwara na ndị ọrụ Covid-19 na Delta steeti bụ ""Task Force"" dọturu geeti etinyere n'akụkụ akwa mmiri ahụ dị n'Asaba ka ndị mmadụ nwe ike gafere. Ginị ka steeti Anambra na Delta na-ekwu? Mgbe BBC kpọtụrụ onye odeeakwụkwọ gọọmentị Delta steeti bụ Chiedu Ebie, o kwuru na ọ maghị maka geeti ọbụla emere ndọtu. O kwukwara na ọ ma na gọomentị Anambra tinyere geeti n'ajụghị ha maọbụ gwa ha maọbụ kpaa ya akpa. ""Ihe a bụ ihe anyị na-akpọ oku kemgbe ka anyị tinye uche mara ihe anyị ga-eme maka okwu a"" ka o kwuru. Ọ sị kwa ""anyị akpọọla ha oku ka ha si Awka bịa zute anyị ka anyị kpaa ya bụ okwu ọfụma"" N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na ha na-akwado ịbanye nzụkọ gbasara ya bụ okwu. O zitekwara ozi sị na steeti abụọ ndị a enweela nzụkọ atọ taa bụ ụbọchị Monde ma kwuo na ha ga-ezute echi iji kpebie ya bụ okwu kpam kpam. ""Ihe dị steeti anyị abụọ mkpa bụ ịlụso ọrịa Coronavirus agha"" ka o kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-56566768,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56566768,"Leornard Onyia: Etu ọnwụ Anando West n'obodo Vikas Puri, India jiri bute ngagharịiwe",Ụmụ Naịjirịa bi n'obodo Vikas Puri dị na mba India ekwuola ihe kpatara ha jiri mee ngagharịiwe n'ụbọchị Sọnde n'obodo ahụ.,"Leonard Onyia nwụrụ n'ụtụtụ Sọnde n'India Otu onye Naịjirịa nọ obodo ahụ achọghị ka akpọọ aha ya niile kwuru na ọ bụ oke ogbugbu ndị Naịjirịa kpatara ngagharịiwe a. Nke a na-abị a ka ndị Naịjirịa kwuru na ndị uweojii kwuru gburu otu onye ọzọ n'ime ha. Dịka BBC Igbo chọpụtara, nwa amadị a e gburu bụ Leonard Onyia e ji ""Anado West"" mara, bụ onye Enugwu Steetị gbara ihe dịka afọ iri anọ na atọ. Akụkọ kwuru na Maazi Eneonyia ebiela na mba India ọtụtụ afọ na e nweghi nsogbu ikike ọbụla. Otu nwaafọ Naịjirịa ọzọ bi n'obodo ahụ gwara BBC Igbo na nke a mere n'ụtụtụ ụbọchị ụka 28 Maachị 2021 mgbe Anaedo na-aga ibute mmadụ n'ọdọụgbọelu. 'Chinedu Okobi nwanne m na-agara onwe ya ndi uweojii Amerika gbuo ya' Ndị uweojii kwụsị ya n'ụzọ ma bido ịgba ya ajụjụọnụ, dịka ha na-ajụ ya ha malitere iji na-eti ya ihe. Nke a mere onye Naịjirịa ọzọ hụrụ ka ihe a na-eme ji bịa ka ha ọzọpụta Anaedo mana ọgbaghara dapụtara n'etiti ha na ndị uweojii ahụ. E buuru Anaedo gawa ụlọọgwụ bụ ebe a nọ kwuo na ọ nwụọla site na mmerụ ihe ndị uweojii kụrụ ya n'azụ olu. N'ihi nke a ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ji iwe na ọnụma malite ime ngagharịiwe n'ebe a kpọrọ 'Outer Ring Road'. Ihe onyonyo ha tinyere na Facebook gosiri ebe ha na-eme ngaghariịwe a. Onye na-anọchiteanya Naịjirịa na mba India bịara ka ọ kụjụọ obi ụmụ Naịjirịa mana ha jụrụ kwuo na ọ bụghị mbụ ụdị ihe a na-eme ha. ""Anyị na-ezozi ezo"" Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwụrụ na ha niile nọzị n'ime ụlọ makana ndị uweojii na-achọ ndị ha ga-anwụchi. Mana, ọ gakwara n'ihu kwuo na atọghapụla ndị niile anwụchiri na ngagharị iwe ahụ ""Ndi anwụchiri ụnyaahụ, atụghapụla ha. Ọ bụ Rupee 25,000 ka eji gbapụta ha. Ọ sị na nke ahu na-ewute ha makana ego ahụ buru ibu."" Ndị uweojii na-agọ n'aka ha adịghị n'ogbugbu a Mana dịka ụlọ ntaakụkọ Hindustan Times siri dee, ndị uweojii India na-agọ n'aka ha adịghị na mkpa mkpa kpara. Dịka ha sirị dee, ndị uweojii kwuru na nyocha ha mere gosiri na onweghi akpa dị nwa amadị a n'ahụ, ma kwuo na ọnwụ ya enweghi etu o siir metụta nzute ya na ndị uweojii nọ ọrụ na mpaghara ahụ ihe a mere. Ha sị na Osote Onyeisi ndị uweojii na mpaghara India ahụ bụ Urvija Goel kwuru na ha na-eche mpụtara nyocha e mere n'ahụ nwa amadị a iji makata ihe gburu ya. Oke mwakpo Ihe onyonyo ụfọdụ ndị Naịjirịa bi India zitere BBC na-egosi ebe a na-awakpo ndị a na-eme ngagharị iwe dịka ndị uweojii na-anwụchi ha. Ndị hụrụ oge ihe a mere na-akọwa nọ ọbụ ụfọdụ ndị India ndị nkịtị na-awakpo ndị a. Ihe onyonyo gosikwara ụfọdụ ndị bu ọbara n'ahụ nke gụnyere otu nwaanyi ọbara juru n'isi. BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ụlọ ọrụ na-anọchịte Naịjirịa n'India mana ha azaghị ekwenti ha. BBC kpọkwara Abike Dabiri-Erewa, bụ onye na-ahụ maka ọdịmma ndi Naịjirịa nọ ofesi mana ya onwe ya azaghị ekwentị ya. Ọ ruola afọ asaa Leonard Eneonyia pụrụ BBC Igbo mechara nwete nwanne nwa amadị a nwụrụ n'ekwentị o were nwa BBC na ọ bụ nnukwute Ọdacgi zutere ezinaụlọ ha. Victor Ejike gwara BBC na ọ bụ afọ asaa Maazị Eneonyia pụrụ njem ma hapụ ezinaụlọ ya na Legọs. Ọ sị na ọ na-akwado ịlọta Naịjirịa tupu ọnwụ na-erụghị erụ a ezute ya. ""Nwunye ya na ndi be ya nọ Legọs. Anyi na-ele anya na ọ ga-abata nso nso a makana ọ ka rụchara ụlọ na-achọzị ịbata."" Maazị Ejike gakwara n'ihu kwuo na ha amatabeghi etu nwanne ya siri zute ọnwụ. ""Ọtụtụ mmadụ na-akọ akụkọ banyere etu nwanne m siri nwụọ. Anyị amabeghị nke bu eziokwu. Ihe nke anyị ma bụ na o nwụru ụnyaahụ bụ Sọnde.""" afirika-47090994,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47090994,Transfer deadline: Nwafọ Naijiria so na ndị akachasị zuo oke ọnụ n'oge a,Otu egwu bọọlụ ndị nọ na Premier League mefuru nde narị anọ na iri atọ paunds( £430m) n'January afọ 2018.,Ha mefuru nde otu narị na ise paụnds naanị n'ụbọchị mmechi azụmahia ndị egwu. Ngalaba na-ahụ maka azụmahịa n'ụlọọrụ Deloitte kwuru na ihe e retara na Jenụwarị afọ bekarịrị ọkara ihe e retara na Jenụwarị afọ 2018. Nwafọ Naijiria bụ Dominic Solanke so na ndị egwu akacha zụọ oke ọnụ ahịa dịka Liverpool nyefere ya ndị Bournemouth n'ọnụ ego nde paụnds iri na itoolu(£19m).. Onye egwu bọọlụ bụ Christian Pulisic agalaa Chelsea ka a zụchara ya nde paunds iri ise na asatọ (£58 m). Newscastle zụrụ Miguel Almiron n'a ndị Atlanta United nde paụnds iri abụọ (£20m) Lee ka ha si kwụrụ: Ndị a kacha zụọ oke ọnụ ahịa na Premier League n'oge azụmahịa ndị egwu nke oge a. A gbakwụnyere ha onye Argentine striker Emiliano Sala si Nante banye Cardiff n'ọnụ ego £15m. A hụbeghị Sala onye gbara afọ iri abụọ na asatọ kemgbe abali iri abụọ na otu nke ọnwa Jenuwari ka ụgbọelu ọnọ na ya furu na Channel Islands. Ndị otu Chelsea binyere ndị egwu ha ụfọdụ na mbibi: afirika-56133446,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56133446,Imo State Isopadec: Ihe mere gọọmentị Imo steeti ji chụọ mmadụ 108 n'ọrụ,Aka na achi steetI Imo bụ Hope Uzodinma achụọla mmadu di otu nari na asatọ bụ ndi ụlọọrụ 'Imo State Oil Producing Areas Development Commssion' (ISOPADEC.),"Ozi si na aka Gomenti Imo kwuru na ihe kpatara e ji chụọ ndị ahụ bụ maka na e si n'azụ ụlọ wee ha n'ọrụ oge Rochas Okorocha nọ n'ọchịchị. Ọnụ na-ekwuru ISOPADEC bụ Ekeh Promise Onyekachi kwenyere na esi n'ụzọ iwu na akwadoghi wee ndị ahụ n'ọrụ. Onyekachi kwukwara na sọsọ ọchụchụ a chụrụ ndị ọrụ agaghi ewetacha mgbanwe tọrọ atọ na ya bụ ulọ ọrụ. Otu onye n'ime ndi ọrụ a achụrụ achụ aha ya bụ Ifereze Victor, katọrọ agwa gọmeenti imo kpara. O kwuru na esi n'ụzọ iwu kwadoro wee ha n'ọrụ. Ifereze Victor kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ nakwa gaasị nke na-enye Imo steeti ego. ""O kwesịghị ka anyị bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ bụrụ ndị na-enweghị ọrụ,"" Ifereze Victor na-ekwu. Cheta na ndị ọrụ ISOPADEC nọrọ n'izụka olemole gara aga mee ngaghari mkpesa, gba abụbụ ọrụ, ma gbachie isi ụlọ ha di n'Owerri n'ihi nchabi ụgwọ ọnwa ha nakwa ụgwọ ochie nke gọọmentị ji ha." 46173182,https://www.bbc.com/igbo/46173182,World War 1: Etu agha a si metụta Afịrịka,"Ụwa niile jiri taa bụ Nuvemba 11, 2018 cheta otu narị afọ ka mgbe a lụrụ agha mba ụwa nke mbụ.","Uwa niile enweela nkpebi na udi agha agaghị amalite ọzọ N'ime nyocha BBC mere achọpụtara na mmadụ nkịtị ruru nde iri (10m) bụ ndị nwụrụ n'agha. Ha chọpụtakwa na ndị agha ruru nde 9.7 sị mba dị iche iche lụrụ agha a tọrọ n'agha a. Ndị agha Naịjirịa ole nwụrụ n'agha a? Ala dị iche iche lụrụ ebe ha na-echeta ndị nwụrụ n'agha a Otu ode akwụkwọ gbasara ihe mere mgbe gboo aha ya bụ Vadim Erlikman dere n'ime akwụkwọ ya ""Handbook of human losses in the 20th century"" na ndị agha Naịjịrịa ruru puku 85 tọrọ n'agha a. Ndị agha Naịjirịa so ndị mba Briten bata yabụ agha. Ọ gụbeghị Ndị mba UK kwuru na ndị ụmụafọ ha ruru puku 886, 342 nwụrụ na yabụ agha. Ha kwukwara na mmadụ nkịtị n'ala ha ruru 109,000 nwụrụ na yabụ agha. Ndị ji akụkọ agha a n'aka na-ekwusike na mmadụ karịrị nde 40 bu ndị nwụru n'agha a. Ebe a ka Frans na-echeta ndị nke ha Nyocha mere ka onyeọbụla na-ekwu na agha a bụ nke kachasị tọrọ isi mmadụ ka mgbe akụkọ ụwa bidoro. Ruo ugbua, ha ka na-achọ mmadụ ruru nde 6 makana ha maghị ma ha nwụrụ anwụ maọbụ ha dị ndụ. N'ime nyocha a BBC mere, a chọpụtakwara na ọ bụ ọrịa gburu ọtụtụ mmadụ n'agha a. Mba dị iche iche so na yabụ agha Ọstralia, Briten, Frans, Jamani, Russia, Austria-Hungary, Turkey, United states na ọtụtụ ala ndị ọzọ so n'agha. Gịnị kpatara agha a? Mba Austria-Hungary busoro Serbia agha n'afọ 1914. Ihe a mere ka Rọshịa bụ mba na-akwado Serbia banye yabụ agha. Jamani banyere na yabu agha maka ha na Rọshịa anaghi ahụ anya anya. Tupu otu ntabi anya, Frans, Belgiom, Briten, Japan na ọtụtụ mba ndị ọzọ nwụbanyere na yabu agha makana a chọrọ ịkwado ndị nke ha na yabụ agha." 49000699,https://www.bbc.com/igbo/49000699,Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie?,Ndị ọkammụta na-agbagha ihe NBS kwuru maka nkwupụta ngalaba na-ahụ maka ngụkọ na Naijiria nke a kpọrọ 'National Bureau of Statistics'(NBS) nke kwuru na ọnụ ahịa adaala karịa etu ọdị n'ọnwa ole gara aga.,"Lee ihe nkiri maka ọnụahị ihe nri Drop in inflation: Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie? NBS kwuru na nsonso na ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa(inflation) agbatuola karịa ka ọ dị n'ọnwa gara aga dịka o jiri 0.18 pasent daa rue 11.22 site na 11.40 pasent ọ bụbu. Mana ụfọdụ ndị ọkachammara n'okwu akụnaụba kwuru na okwu ahụ adabeghị. Ọnụ ahịa adaala n'ezie Ha kwuru na ka ọ dị ugbua, na Naijiria enweghị akụnaụba ọbụla ma ya fọkwa nke na-aga n'ihu. Ha na-ajụ ajụjụ ebe NBS siri nweta ozi(data) ha gbadoro ụkwụ were nwee mkpebi ha. Ndị aha kwuru n'ọnụ ihe oriri adaala n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria Mana ụfọdụ na-ekwu na ya bụ ozi si n'aka NBS kwụ ọtọ ka sịga. Ndị ahịa BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru n'ọnụ ahịa ji, garị , akịdị na agwa adaala karịa ole e rere ya n'oge a n'afọ gara aga. Ọnụ ahịa nrị na-ada ugbua adaala karia ihe ọ dara n'n'afọ 2018 Ọkammụta n'ihe gbasara akụnaba bụ Boniface Chizea gwara BBC n'ezie n'ihe ọnụahịa na-ada gbadara. Chizea gara n'ihu gbaa ama na ọ ga-ewe oge tupu ọ pụta ihe. Ihe mgbada ọnụ ahịa pụtara ụmụ Naijiri- Ọkachamara akụnaụba Ọ kọwara na ihe ozi NBS wepụtara pụtara bụ ""na ego ndị mmadụ nwetara ha ga-eji ya zụta ihe karịa ka ọ dị na mbụ."" Chizea kwusiri ike na NBS tozuru etozuu na iwepụta ozi kwesiri ntụkwasi obi ma rụtụ aka na oge Naijiria nwere 'recession' na ha gbara ya bụ nsogbu n'anwụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44755784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755784,Kemi Adeosun: Ihe NYSC kwuru maka asambodo,Ụlọọrụ na-ahụ maka ife ala nna akpọrọ NYSC n'ịchafu amanyela ọnụ n'okwu gbasara mmerụaka dị n'asambodo minista na-ahụ maka akụ na ụba na Naịjirịa bụ Kemi Adeosun.,"Adeosun bubu kọmishọna na-ahụ maka ego na Ogun steeti N'akwụkwọ onye na-ekwuchitere ha ọnụ bụ Adeyemi Adenike depụtara n'ụbọchị Julai 9, ha kwetere na Adeosun debara aha n'akwụkwọ iwezuga onwe i sonye n'emume ife ala nna. Ha kwukwara na ha ga-elebanya na ya bụ asambodo aghụghọ. N'ọnụ ha ""anyị a nụla maka ihe gbasara asambodo aghughọ ekwuru na Adeosun jiri nweta ọkwa ya. Mgbe anyi lebara anya n'akwụkwọ anyị, anyị chọpụtara na o denyere aha maka i nweta asambodo nwezuga.'' Cheta na ndị ntaakụkọ ''Premium Times'' deputara akụkọ na-agaharịnụ na Adeosun emeghị emume ife ala nna ma nwetakwa asambodo nwezuga aghụghọ. Emume ife ala nna a bụ nke onye ọ bụla gụchara Mahadum na-erubeghị afọ iri na atọ ga-emeriri. Ruo ugbua Adeosun ekwubeghị ihe ọ bụla gbasara ya bụ ebubo. Adeosun achịala dịka kọmishọna na-ahụ maka ego na Ogun steeti site n'afọ 2011 ruo 2015 mgbe Ibikunle Amosun na-achi dika gọvanọ. O mechara soro ọchịchị Muhammdu Buhari dika Minista na-ahụ maka akụ na ụba n'afọ 2015. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43447112,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43447112,Russia bidoro ntụliaka taa iji chọpụta onyeisiala ọhụrụ,Ebe a na-ebinye aka emeghela na Mba Russia ebe ndị mba ahụ jisike na-apụta ị binye aka maka onye ga-achị ha n'ọdịnihu.,"Putin na-atụ anya ị chị Russia na agba nke anọ Onyeisi ala nọ n'ọkwa ọchịchị bụ Vladimir Putin nọ na-atụ anya na ya ga achị Russia na agba nke anọ. Ntuliaka ahụ malitere ebe ọ kụrụ elekere asatọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Russia ma bido kwa ebe elekere itoolu gachara na Moscow bụ isi obodo Russia. A na atụ anya ihe ntuliaka a pụtara ga-apụta na mgbede taa bụ ụbọchị ụka iji mara onye meriri. Vladimir Putin, dị afọ 65, malitere ị chị mba Russia n'afọ 1999. Ndị na-azọ ọchịchị na Russia Ha ruru mmadụ asaa n'agụnyeghị Onyeisiala Putin na-azọ ọkwa ọchịchị na Russia. Lee ha na otu ha dị ịcheịche ebe a: Pavel Grudinin: Ya bụ onye na kwudoro ndị Pati Komunist. Vladimir Zhirinovsky: Bụ onyeisi otu ndị LDPR. Grigory Yavlinsky: Yavlinsky bụ onye bidoro otu Yabloko Liberal nke ndị Russia. Ksenia Sobchak: Ya bụ sọsọ nwaanyị na-azọ ọchichị otu ya bụ Liberal Party Civic Initiative. Boris Titov: Titov kwunyere ndị Party Ọganiru (Growth). Sergey Baburin: Bụ onye isi Pati Ogbakọ ndị Russia niile (Russian All-People's Union party). Maxim Suraykin: Bụ onye ọzọ na-anọchite anya ndị Pati Komunist. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50915325,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50915325,Sagamu Interchange Bridge: E mechiela akwa Shagamu,Ngalaba na-ahụ maka ihazi njem okporoụzọ bụ FRSC n'aha ịchafụ amaala ọkwa mmechi Akwa Sagami dị n'Ogun steeti.,"Ihe mberede ọkporoụzọ mere n'okpuru Akwa Shagamu Nke a na-eme dịka ọkụ si na nnukwu ụgbọala na-ebu mmanụ zụkọtara ọnụ gbara akwa ahụ n'ụbọchị Ekeresimesi. N'ozi ọnụ na-ekwuru FRSC n'Ogun steeti bụ Florence Okpe wepụtara nye ndị ntaakụkọ, o kwuru na nnyocha ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ọrụ mere gosiri na ọnọdụ akwa ahụ adịzịghị mma n'ihi ọkụ ahụ gbara ya. Nke mere o ji dị mkpa ịrụzi ya .N'ihi nke a, FRSC nyere ntuziaka ka ụgbọala ndị si ala Igbo abata site n'Ijebu Ode si ụzọ gara n'azụ ụlọọgwụ 'FRSC Emergency Road Side Clinic' dị na Sagamu ma tụgharịa tuppu ha erute Ogere. Ha kwukwara ka ndị si Abeokuta na-aga Legọs si ụzọ Kara-Shagamu ma a gaafecha 'Julius Berger Yard' were sonyekwa Okporoụzọ si Sagamu- Ijebu Ode - Ore gawa Benin Christmas Day Visit: Kpọwanụ m 'Baba go slow', a ga m arụ ọrụ m - Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọnụ ụfọdụ ndị mmadụ agaghị eme ka ọ kwụsị ịrụ ọrụ ya nke ọma dịka onyeisiala. Buhari kwuru nke a oge ọ nabatara ndị ọbịa bịara kelee ya maka emume ekeresimesi n'Aso Villa. O kwuru na ndị hụrụ ya n'anya n'ihi ọrụ ọma ọ na-arụ karịrị ndị na-akọcha ya. Buhari kwuru sị: ""Oge m kpagharịrị steeti iri atọ n'isii nke Naịjirịa maka ịchụ nta vootu, a chọpụtara m na ndị mmadụ pụtara ige m ntị abụghị ndị mmadụ ọbụla ga-akwunwu ụgwọ."" ""Nke a mere ka m mata na ndị na-akwado m karịrị n'ọnụọgụgụ."" ""Eji m akwụkwọ iwu Naịjirịa ṅụọ iyi. A ga m arụ ọrụ m nke ọma, ọ masị ndị mmadụ ha kpọwa m 'Baba Go Slow'. Nwoke etigbuola nwunye ya Ndị na-eme ejije gbasara nwoke na'akụ nwụnye ya ihe Akụkọ na-ekwu na aka ndị uweojii akparala otu nwoke ji aka tigbuo nwunye ya ụbọchị ekeresimesi. Nwoke a aha ya bụ Mutiu Sonola gbara afọ iri atọ na asaa. Onụ na-ekwuru ndị uweojii Ogun State bụ Abimbola Oyeyemi kwuru na nnyocha ha mere gosiri na nwoke ahụ na-eji nwunye ya amụ ọkpọ kwa mgbe. Oyeyemi kwuru na Sonola gbara ọsọ oge ọ hụrụ na nwunye ya adaala n'ala. Ọ bụ nna nwata nwanyị ahụ gbatara buru nwa ya gawa ụlọọgwụ ebe dọkịta gwara ya na ọ nwụọla. Sonola ka nọ na mkpọrọ ndị uweojii ezu ike ugbua. Na Japan Mínísta na-ahụ maka ikpe nwkụmọtọ na Japan, Masako Mori Mba Japan akwụgbuola otu nwoke onye mba China a mara ikpe ọnwụ maka igbu otu ezinaụlọ n'afọ 2003. Nwoke a aha ya bụ Wei Wei gburu mmadụ anọ n'otu ezinaụlọ nke gunyere di, nwunye na ụmụ ha abụọ. Nke a bụ nke mbụ n'ime afọ iri Japan na-egbu onye mbịarambiara a mara ikpe ọnwụ n' obodo ahụ. Ihe karịrị otu narị mmadụ bụ ndị amkpọrọ a mara ikpe ọnwụ na japan. Anaghị agwa ha ụbọchị a ga-egbu ha ganye n'ụbọchị ahụ eruo. Egwuregwu bọọlụ 'Boxing Day' Ndị Southampton meriri ndị Chelsea 2 - 0 Otu egwuregwu bọọlụ niile so n'asọmpi English Premier League zutere onwe n'ụbọchị Tọzde dịka omenala mba England si dị. A na-enwekarị asọmpi bọọlụ kwa ụbọchị 'boxing day' ọbụla na mba England iji mee ka emume ekeresimesi na-ekpowanye ọkụ. Ajọ ikuku na Philippines Ndị bi n'obodo Ormoc na-egwufe na mmiri Ihe ruru mmadụ iri anwụọla ka ajọ ifufe zakọrọ ndị mmadụ na mba Filipịns ụnyaahụ. Ajọ ifufe ahụ a kpọrọ 'typhoon phanfone' na Bekee, ekweghị ihe karịrị mmadụ puku iri laruo ụlọ, ka ha na-eche ụgbọ ndị ga-ebula ha ụlọ ekeresimesi. #Khadoni apụtala ihe: Khafi Khareem nke Big Brother Nigeria Pepper Dem ekwela ịlụ Gedoni Ekpata ya na ya yịwara n'ụlọ ahụ. Khafi obi na-atọ pọlina pọlina depụtara nke a n'elu soshal midia ya ebe o dere sị ""Enwetara m onyinye Ekeresimesi kachasị mma'. Ị nyere nne na nna gị onyinye ọbụla n'izu a? Ọ bụrụ na ị nyeghi, bịa mụta n'aka Francisca Ordega na-agbara Super Falcons nke Naịjirịa bọolụ. Ordega tinyere ihe onyonyo gosiri ebe nne na nna ya na-agba egwu maka ụgbọala ọhụrụ ọ zụtaara ya, ma na-enwe olileanya inye nne ya ụlọ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. Ụgbọmmiri ekpuola na Tọki. Mmadụ asaa anwụọla ka ụgbọmmiri bu ndị mbịarambịara si mba dị iche iche kpuru na mba Tọki. A zọpụtara mmadụ iri isii na anọ bụ ndị a kpọgara ụlọọgwụ, ebe a ka na-enyocha ihe ha nọ na-eme n'ụgbọmmiri ahụ. N'egwuregwu, Jurgen Klopp nke Liverpool ekwuola na ọ bụ njọ na ụfọdụ klọb dị na Premier League ga-agba egwuregwu abụọ n'ime ụbọchị atọ. Cheta na Pep Guardiola nke Manchester City tikwara ụdịrị mkpu a ụbọchị ole na ole gara aga. Ndị Miyetti Allah nwere okwu banyere ndị gọvanọ Owuwa-anyanwụ Ndị otu Miyetti Allah ekeleela ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ maka etu ha si etinye uchu na njikọta obodo. N'ekele ekeresimesi onyeisi nke mpaghara ọwụwa-anywanwụ bụ Alhaji Gidado Siddiki zipuru n'Anambara, o kelere ndị gọvanọ a maka etu ha si nabata ndị otu ha na steeti ha. 'Anyị anwụchighi Sowore maka na ọ bụ onyentaakụkọ' Garba Shehu Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu ekwuola na ọ chọrọ ka ndị mba ofesi mara na gọomentị Buhari anwụchibeghi onye ntaakụkọ ọbụla maọbụ mechie ụlọntaakụkọ ọbụla kemgbe 2015 ọ banyere ọchịchị. Shehu kwuru sị na ha anwụchighi Omoyele Sowore maka na ọ bụ onye ntaakụkọ, kama na ọ bụ maka ọkwa 'ikwatu gọomentị' ọ mara. Ihe ga-eme na Premier League taa: Ka ị na-ezu ike n'ụlọ gị ka a ga na-enyo ma ndị nchịkọta ọhụrụ a zụtara na Premier League a ga-azanwukwa aha nna ha. Ancelotti ka banyere n'ihe bụ afọ abụọ dịka onye nchịkọta Napoli, tupu a chụọ ya Onye dịka Carlo Ancelotti ga-egosi ma ego Everton ji zụta ya ọ bụ n'efu mgbe ha ga-ezute Burnley ebe elekere atọ nke ehihie taa. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi" afirika-47888514,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47888514,Unemployment in Nigeria: Ọrụ asaa ị ga-ebidonwu na be gị ga-eme gị 'ide ji ego',Ọrụaka ndị a ga-ekwu maka ya n'akụkọ a ga-enyenwu gị ego n'ime ụlọ gị.,"Ngalaba na-ahụ maka ndekọ ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ ""Nigeria Bureau of Statistics"" si kwuo, ọnụọgụgụ ndị enweghi ọrụ na-arịgo kwa afọ. Nchọpụta a mere ka ọtụtụ ndị na-agba mbọ ibido akaọrụ na-abụghị ọrụ bekee ha ga-eji na-emegharị aka nakwa na-akpata ego. BBC Igbo kpọkuru otu onye ọkachamara n'ihe gbasara achụmnta ego bụ Amarachi Nwankwo, onye kọwara ọrụaka iri ị ga-ebidonwu n'ime ụlọ gị. Lee akaọrụ ndị ahụ ebe a: 1) Ilekọta ụmụaka: Ọtụtụ ndị agaghị ahụta nke a ka ọrụ, mana ị ma na ị ga-ejinwu ilekọta ụmụaka ndị enyi gị, ụmụnne gị nakwa ndị agbataobi gị kpara ego? A na-eme ya bụ ihe bekee kpọrọ ""babysitting"" n'obodo oyibo, gịnị ga-akwụsị gị iji ya akpata ego na Naịjirịa? Ebe o si ka mma bụ na ị ga-anọ n'ụlọ gị nwee ike iji ndụ gị mere ihe ka ị na-elekọta ụmụaka ndị e tinyere gị n'aka, ma narakwa ego tinye n'akpa. 2) Ikuzi nkuzi: Ị bụ ""nwa teacher""? Mba! Mana ị ma na ị ga-abụnwu? Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ bekee anaghị enwe efe enyere ụmụ ha aka ime ihe ndị nkuzi nyere ha rụọ n'ụlọ, mana ọ ga-amasị ha ịkwụ ụgwọ ka onye ọzọ nyere ha ụdịrị aka ahụ Nkuzi nke a abụghị ịga mepee ụlọakwụkwọ, kama ọ bụ ikuziri ndị mmadụ ihe ndị ị ma maka ihe ndị dị iche iche. Ọ bụrụ na ị chọghị ime nke ahụ, i nwereike na-akuziri ụmụaka akwụkwọ ma ha si n'ụlọakwụkwọ bata bụ nke ndị bekee kpọrọ ""home lesson"". Ebe o si ka mma bụ na ị ga-emenwu nke n'ofu akụkụ n'ime ụlọ gị, narakwa ego gị. 3) Ire ihe na soshal midia: Ọ bụrụ na ị maghị na a na-erezi ihe na soshal midia ugbua, mara na ị ka bi n'okpuru nkume. Ndị mmadụ na-ere ọtụtụ ihe dịka akwa nke ọhụrụ nakwa ọkịrịka, akpụkpọụkwụ, nri nakwa ngwa nri, mmanya, ụgbọala, nka na ihe ndị ọzọ n'elu soshal midia. Ebe o si ka mma bụ na ị ga-anọnwu n'ime ụlọ gị na-akpata akụ a site n'ire ihe ndị dị iche iche. 4) Ịkọ akwụkwọ nri: Ị ma na ọ bụghị naanị mgbe ị nwere nnukwu ugbo ka ị ga-esinwu na ya kpata ego? Ọ bụrụ na ị nwere ọbụrụgodi obere ubi, ị ga-ejinwu ya kọta ihe ndị dịka akwụkwọ nri. I si n'ime ụlọ gị na-ere akwụkwọ nri ndị a na ngwa nri ndị ọzọ, ọ ga na-enye gị ego ị ga-ejinwu lekọta onwe gị. 5) Ịkpa isi na Ịkpụ isi: Ị ma na ị nwereike ị na-akpa isi n'ime ụlọ gị na-akpata ego? Ị malite ịna onye agbataobi gị ahụ maọbụ enyi gị nwaanyị ahụ ego tupu ị kpaa ya isi, ị ma na ọ ga-eme ka ego na-adị gị n'aka? Kingsley na-akpa isi Ị kpaa maọbụ kpụọ ha isi ọfụma, ha ga-edutere gị ndị ọzọ, makana Igbo na-ekwu na ""ahịa ọma na-ere onwe ya"". 6) Isụ akwa: Ị ma na ị ga-ejinwu ịsụ akwa nweta ego ị ga-eji fọjuo akpa gị? Makana ọtụtụ ndị ọrụ bekee anaghị enwe ohere, ọkachasị ndị bi na Legọs bụ ndị ahịrị na-egbu oge, inweta ohere ịsa akwa na-ara ụfọdụ ahụ. Ebe a ka ị ga-esi kpata ego gị maọbụrụ na ị malite ịnapụta ha ego tupu ị saara ha akwa. Elela anya ebe tere aka, bido n'agbataobi gị. 7) ""Blogging"" Ị ma ego ole ị ga-anọnwu n'elu akwa gị kpata ma ọ bụrụ na ị malite ide ihe n'elu igwe kọmputa gị? Jụọ Linda Ikeji na ndị ọzọ dịka ya etu ha si si n'ide ihe malite ịkpata ego, ma bakwaa ọgaranya. Malite otu n'ime ihe ntuziaka ndị a nakwa ndị ọzọ gụnyere ịkwa akwa, ire ngwa nri, ịzụ ọkụkọ nakwa ihe ndị ọzọ, taa, ka ị nyere onwe gị aka makwa tinye ego n'akpa gị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53879435,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53879435,Allen Onyema: Onyeisi ụlọọrụ Air Peace kwuru na ọ bụghị eziokwu na Buhari kpọrọ ndị Igbo asị,"""Buharị akpọghị ndị Igbo asị. Ọ chọrọ ka mpaghara Naịjirịa niile dị mma ma mepee emepe.""","Onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila kelere Allen Onyema maka aka ọ na-enyere Naịjirịa Nke a bụ okwu Allen Onyema, onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu a ma ama bụ Air Peace. Onyema kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ 'Anambra Broadcasting Service' gbara ya ajụjụ ọnụ n'obodo ya bụ Mbosi, n'okpuru ọchịchị Ihiala. Ọ kọwara na ya bụ onye Igbo mana onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ya na ụlọọrụ ya nkwado pụrụ nnukwu iche. Onyema gara n'ihu kwuo na Buhari nyere ụlọọrụ ya ikike ịga ọtụtụ mba ofesi dị icheiche. O kwuru sị: ""A na m ekele Chukwu maka onyeisiala anyị bụ Muhammadu Buhari"" ""Ọ bụghị eziokwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị."" Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu ""Esoghi m n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla mana eritela m ọtụtụ uru na nkwado nke ọ na-enye ụlọọrụ ndị Naịjirịa nwe."" ""Mana ọtụtụ mmadụ amaghị nke a. Ndị mmadụ na-ekweta ihe ọbụla ha gụtara n'akwụkwọ ntaakụkọ."" ""Gọọmentị etiti nyere m ikike ifega mba ofesi dị icheiche nke ha na-enyetụbeghị onye ọzọ. Mana abụ m onye Igbo, onye Anambra. ""Amaghị m onye ọbụla, enweghi m nnaukwu (godfather) ọbụla."" Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka ""Site n'aka Mịnịsta njem ụgbọelu, onyeisiala Buhari nyere m ikike ifega mba Chaịna, London, Portugal, US, India na Europe niile."" ""Abụghị m onye alakụba, mana onyeisiala nyere m ikike ịga obodo Jedda (dị na Saudi Arabia)."" ""Gọọmentị enyela ụlọọrụ m ikike ịga ihe karịrị mba iri abụọ, mana abụ m onye Igbo. Kedụzi ihe ndị mmadụ ji ekwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị?"" Onyema kwuru na obi siri ya ike na Buhari ga-akwado ọdọụgbọelu ọhụrụ nke gọọmentị Anambra steeti na-arụ. Allen Onyema, Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila, na onyeisi ndị pati PDP n'ụlọ omeiwu nta bụ Ndudi Elumelu Cheta na ụlọọrụ Air Peace bụbu naanị na Naịjirịa ka ha na-efe, mana ugbu a ha na-efegazi ọtụtụ mba dị icheiche, nke Allen Onyema kwuru na ọ bụ site na nkwado onyeisiala Buhari Oge ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba South Africa n'ihi ọgbaaghara 'xenophobia', Onyema bupụtara ụgbọelu ya ka o bulata ha na-akwụghị ụgwọ ọbụla. N'oge coronavirus a, ụgbọelu Air Peace ebulatakwala ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba ofesi dị icheiche. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Okwesilieze Nwodo: Ọ bụrụ na-enyeghi onye Igbo ọkwa onyeisi Naịjirịa, ihe ga-emebi" afirika-45518369,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45518369,Kemi Adeosun: Ihe mere m ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm,Adeosun kwuru nke a n'akwụkwọ ozi arụkwaghịm o degaara onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari.,"Ụnyaahụ bụ Frịade, Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghịm nke onyeisiala kwukwara n'otu ụbọchị ahụ na ya anabatala ya. Ọ kọwara sị: ""A hụrụ m taa nyocha e mere banyere ebubo iji asambodo adigboroja NYSC na-arụ ọrụ nke otu ụlọ ntaakụkọ nọ n'ịntanet boro m. Ọ bụ ihe ịtụnanya ịchọpụta na asambodo NYSC m wetara abụghị ezigbo ya. Ya mere m ji gbado ụkwụ n'ịkwụwa aka ọtọ nke ọchịchị a were na-asị ka m kwanyere onwe m ugwu rituo n'ọkwa."" Ọ gara n'ịhụ kọọ akụkọ etu nne na nna ya siri mụọ ya na mba Briten ebe ọ nọrọ too. E duru Kemi Adeosun iyi ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego n'afọ 2015 Kọọwa na ọbịbịa ya n'ala Naịjịrịa na-abụkarị oge ezumike were rute mgbe ọ gbachara afọ 34. Ọ bụ oge ahụ ka ọ natara akwụkwọ ikike mbụ ya dịka onye Naijiria. O kwuru na ọ bụ ka ọ lọtara Naijiria ka okwu iwu iji otu afọ fee ala Naijiria iji ya malitere. ""A gwara m na agafeela m afọ 30 maka ife ala nna. Ọ bụ ndị nọ m nso nyere m aka ị ga NYSC hụ na m nwetara akwọkwọ na-egosi na a gafeelam afọ ole e ji efe ala Naijiria. ""Dịka m arụbeghị na NYSC maọbụ ga n'ụlọọrụ ha, ọ tụghị m n'uche na asambodo ahụ abụghị nke ezigbo ya. ""N'ezie, ọ bụ asambodo ahụ ka m nyere ndị ụlọomeiwu Ogun steeti n'afọ 211 nakwa DSS na Ụlọomeiwu etiti n'afọ 2015."" Cheta na kemgbe ọnwa Julaị oge ụlọọrụ akụkọ Premium Times gbara ya n'anwụ, ebubo ịkpụ asambodo NYSC adịgboroja dọrọ ya bụ nwaanyị rụburu ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego n'Ogun steeti na ọchịchị Buhari n'olu ka ibu anyịdanda. Ọtụtụ kpọrọ Buhari oku ka ọ chụọ ya n'ọrụ ma kpụpụ ya ụlọikpe. Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị dịka Reno Omokri a gbagharala ya dịka ọ rituru n'ọkwa. Mana ụfọdụ dịka Adụllaziz Bakare ka na-akpọ oku ka a ọ ga ụlọikpe ga zara ọnụ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45238121,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45238121,Fresh FM: 'Gọọmentị kuturu ụlọọrụ m maka ndọrọndọrọ ọchịchị' - Ayefele,Gọọmentị Oyo state n'utụtụ taa kuturu ụlọọrụ Fresh FM bụbụ ụlọọrụ onye otiegwu aha ya bụ Yinka Ayefele.,"Nke mere ya ugbo abụọ gọọmenti tinyere aka n'ụlọ a Ihe a mere na-ebe akpọrọ Challenge n'ime isi obodo steetị ahụ bụ Ibadan. Gọọmentị kwuru na ha mere ihe a makana Ayefele lụrụ ụlọọrụ a na-ebe o kwesighị ịlụ ụlọ. Mana Ayefele na-agọ ebubo a, o kwuru na gọọmentị na-emegbu ya maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. O kwukwara na akwụkwọ ikike ya ịrụ ụlo a zuru ezu. Ọ sị na ka ọ dị ugbua, a na-enyocha okwu a n'ụlọikpe. N'eziokwu, okaikpe I. Yerima kpebiri na ụbọchị 20 n'ime ọnwa a ga-abụ ụbọchị a ga-elebe anya na yabụ okwu. Ajumobi na Ayefele Ihe a bụ ihe mere ikutu ụlọ a taa jiri tụọ ndị mmadụ n'anya makana gọọmentị gara n'ihu kutuo yabụ ụlọ na-agbanyeghị na okwu a nọ n'ụlọikpe. Ihe mere taa Yinka Ayefele gwara ndị ntaakụkọ na ndị ụlọọrụ gọọmentị na otu nnukwu ụgbọala na-akutu ụlọ biara ụlọọrụ ya n'elekere anọ n'ụtụtụ taa. O kwuru na; ""Oge anyị pụtara ka anyị hụrụ na ha bụ ndị gọọmentị. Mgbe ahụ ka anyị bidoro iti mkpu"" Ha kuturu yabụ ụlọọrụ n'ime otu elekere. Ugbua igwe mmadụ nọ ebe ahụ na ekiri ihe mere. Gọọmentị gbara ụlọọrụ Ayefele akwụkwọ n'ụbọchị monde, na ha ga-abịa ịkutu ụlọọrụ ha na ngwụcha ụbọchị atọ. Aziza gọọmentị Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Toye Arulogun gwara onye ntaakụkọ BBC na ebubo Ayefele boro gọọmentị na ha na-emegbu ya maka okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị eziokwu. O kwuru na akuturu ụlọọrụ a makana ọ dị n'akụkụ okporoụzọ. O kwukwara na Ayefele nupuru isi n'iwu makana oge ọ lụrụ ụlọ a, o kwughi na ọ ga-eji ya mee ụlọọrụ mgbasa ozi redio. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52397559,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52397559,Imo State: Enweghị mgbe Uzodinma ji mee m Emir - Onyeisi ndị Alakụba Imo steeti,Onyeisi ndị alakụba n'Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku ekwuola na onweghị mgbe gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ji mee ya Emir na steeti ahụ.,"Suleiman kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ehihie Fraịde. Akụkọ wuru ewu n'oge gara aga na Uzodinma ehibela Emir na Imo steeti, mana Suleiman kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu. Suleiman kwukwara na e nwere ọgbakọ ndị alakụba na steeti dị iche iche n'ala Igbo. O kwuru na nna ya mụrụ ya na ụmụnne ya n'ụsọrọ Islam, ya agụọ akwụkwọ ndị bekee gụkwaa nke alakụba. Ọ rịọrọ ka ndị mmadụ ghara ị na-ahụ ndị Islam niile dịka ndị ogbu ara ọbara makana a bịa n'otu ọbụla a ga-enwe ndị ọma na ndị ọjọ. Gbasara okwu Biafra, Suleiman kwuru na Biafra ga adịrị ala Igbo mma ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe Chukwu kwadoro. Ọ kọwara na ihe niile dị Chineke n'aka n'ihi na ọ bụ ihe o kwuru ga-eme. Gbasara ndị ụka alakụba na-amalite oge Ramadan ha, bụ oge ha ji ebu ọnụ na-ekpe ekpere, Suleiman rịọrọ ndị ụka Islam n'ala Igbo ka ha hụ mmadụ ibe ha n'anya ma na-enyere ndị onweghị ka ọ ha ha aka. O kwukwara na ọbụghị eziokwu na Islam kwenyere na onye gburu mmadụ n'ihi okwukwe ya ga-aga eligwe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-48080629,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48080629,Man United vs Chelsea: Egwu a nyụru ka ọkụ mana Chelsea alaferela,"Manchester United na Chelsea akwakọrịtala mpị taa n'Old Trafford bụ ebe ha ji otu ọkpụ, otu ọkpụ gbaa akaahịa n'ọkara nke mbụ.","Belgian na Hazard Juan Mata nke Manchester United bu ụzọ tinye goolu nke mbụ na mpio ndị Chelsea na nkeji iri na otu ebe Chelsea gbaara isi onwe ha na nkeji iri anọ na atọ site n'aka Marcus Alonso. Ya bụ egwu bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ nke bụ na mpe mpe akwụkwọ edo edo ruru ise e nyere ndị rụsara ibe ha arụrụala na ya bụ egwuruegwu. Manchester United ji atọ ebe Chelsea ji abụọ. Okwu a kpụ n'ọnụ na ya bụ egwuruegwu bụ mmeghie aka David de Gea bụ ochee goolu ndị Man Utd bụ nke mere e ji nye ha goolu ahụ. Nke a mere ka ebumnobi ndị Manchester United ịgba Champions League ọzọ dịzị ka ọkụ chọrọ ịnyụ anyụ. Bụ nke nyere Chelsea ohere ịnọsi ike n'ogogo nke anọ ebe Man Utd gbara ọnyụpa na ndị nke isii (6). Egwuruegwu a bere n'otu ọkpụ, otu ọkpụ ka e gbuchiri. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53047787,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53047787,Aisha Buhari: Ugboro ise o tiri mkpu maka Aso Rock,Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari abụghị onye a na-afịonye n'akpa.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ọ bụ onye na-ekwupụta uche obi ya oge niile. Akụkọ a ga-egosipụta oge ise ude ya dere Naijirịa maka okwu o kwuru. ""Ka onyeisi ndị uweojii tọghapụ ndị ọrụ m"" Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka akụkọ na-ekwu na-agbara egbe n'ụlọ obibi onyeisiala. Akụkọ na-ekwu na nwunye onyeisiala chọrọ ka onye ọrụ enyemaka nke onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Sabiu Yusuf dopụ onwe ya iche dika o si Legọs bata Abuja maka mgbochi nje coronavirus. Akụkọ gara n'ihu kọwaa na Aisha, ụmụ ya abụọ na onye nchekwa ya soro gaa ị gwa Sabiu ka ọ dopu onwe ya iche izuụka abụọ dịka iwu kwuru. Nke a butere esemokwu dịka Sabiu jụrụ were sị na ọ bu gini mere nwunye onyeisiala agaghị gwa onye na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Ibrahim Gambari ka ọ dopu onwe ya iche dịka ọ na-emekarị njem oge niile. Onye nchekwa Aisha bụ Usman Shugaba gbara egbe dịka ha chọro iji ike jide Sabiu, kama sabiu riri mbọmbo ọsọ. Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Adamu Mohammed nyere iwu ka anwuchie ndị nchekwa nwunye onyeisiala n'ihi ha sị na ịgba egbe n'ụlọ obibi onyeisiala dara iwu. Nke mere ka Aisha Buhari gaa n'akara Twitter ya si ka onyeisi ndị uweojii tọghapụ ndị nchekwa ya ha nwuchiri. ""Garba Shehu na-ebuso ezinụlọ m agha"" - Aisha Buhari N'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Disemba afọ 2019 ka nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buharị depụtara akwụkwọ ebe o boro onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke onyeisiala bụ Graba Shehu ebubo imegide ya na ezinụlo onyeisiala. Aisha Buhari kwuru na Shehu nwere ndị ọ na-arụrụ na ọ bụghị onyeisiala ma sị kwa na o bụ ndị a na-agwa ya ihe ọ na-eme. O kwukwara na Garba Shehu anaghị arụ ọrụ ya dịka onye mgbasaozi onyeisiala dịka ọ naghi egosipụta ezigbo ọrụ onyeisiala na-arụ. Aisha Buhari ji akụkọ wuru na e ji ike gbachịgide ya n'ụlọ n'ihi na onyeisiala chọrọ ịlu nwunye ọzọ were maa atụ. Ọ kọwara na Garba Shehu ma na akụkọ abụ bu asi ma na onweghi ihe o kwuru maọbụ mee iji hụ na eziokwu pụtara ihe. O kwukwara na Shehu na-etinye aka n'ụlọ ọrụ nwunye onyeisiala na-agbanyeghi na ọ gbasaghị ya. ""Enwerike agaghị m akwado di m n'oge ntụlịaka"" - Aisha Buhari Mgbe nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari na ndị BBC nwere mkparịta ụka n'ọnwa Oktoba afọ 2016, ọ gwara ha na o nwerike ọ gaghị eso na ntụliaka agba nke abụọ e mere n'afọ 2019. Aisha sị na nke a bụ maka na ụfọdụ ndị a napụla dị ya ike ọchịchi nke butere na ụfọdụ ndị nọ n'oche ọchịchi di iche iche abụghị ndị otu ndọrọndọro APC ma sị kwa na ha amaghị atụmatụ otu ha hiwere maka ọ dị mma Naijirịa. Gere ya ebe a BBC ""Naijirịa kwesịrị inyocha Soshal Midia"" Mgbe ndị ụloomeiwu na atule ma ha a ga-ehiwe iwu ga-amachị ma nyocha ihe ndị Naijirịa na-eme na Soshal midịa ka Aisha Buhari kwadoro ka ndị ụlọomeiwu hiwe ya bụ iwu . O kwuru sị "" Maka okwu soshal midia a, ị kwesiri ị nọ n'ụlo gị na-atụ asị kwuo na osote onyeisiala akwụsịla ọrụ? Okwu a abụghị obere okwu. Ọ bụrụ na mba Chaina ga-enyocha nwụ ihe mmadụ otu ijeri na ụma na-eme na soshal Midia, enweghị ihe m hụrụ dị njọ ma Naijirịa na-enocha mmadụ nde nari iri asatọ"". Nke kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ iwe nke ha gosipụtara na soshal midia. ""Amaghị m otu ndọrọndọrọ nwunyem nọ kama ama m na ọnọdụ ya bụ na usekwu m, obi m na ime ụlo nke ọzo"" - Muhammadu Buhari Mgbe ndị BBC na Aisha Buhari nwere mkparịtaụka, o kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari amaghị ọtụtụ ndị ya na ha so arụ ọrụ, ma sịkwa na ọ dịrị etu a na ya agaghị eso mee ntuliaka. Dịka onyeisiala Buhari gara mba Jamanị, ndị ntaakụkọ jụrụ ya maka ihe Aisha kwuru o were zaa ha na ọrụ nwunye ya nọ, kama na ihe ọ ma bụ na ọ bụ n'usekwu ya na 'imeụlo nke ọzọ' ka nwunye ya nwere ọnọdụ. Okwu a kpasuru ọtụtụ ụmụnwaanyị iwe nke mere ka ha metere Aisha ebere." 42985390,https://www.bbc.com/igbo/42985390,Lai Mohammed: Amaghị m na EFCC na-enyocha Yusuf,Lai Mohammed kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ọ na-asa ndị ntaakụkọ okwu ka emechara nzukọ ndị ime obi nke gọọmentị etiti.,"Lai Mohammed ekwuola na ọ maghị na EFCC na-enyocha onyeisi ngalaba ịnshọransị ahụike bụ Yusuf O siri na ọ maghị na ngalaba na-ahụ maka ibu agha megide mpụ na mmerụaka na-enyocha onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ịnshọransị ahụike bụ Usman Yusuf, maka ebubo eboro ya. Na'afọ gara aga, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Prof. Isaac Adewole, kwụsịrị Yusuf ọrụ n'ike ganye mgbe EFCC ga-emecha nyocha ebubo na o (Yusuf) mefuru nde otu narị iri itoolu na otu naira na mpụ ndị ọzọ. Mana onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari nyere iwu ga-akpọghachi ya n'ọrụ. Lai Mohammed sịrị: ""Amaghị na EFCC na-enyocha Yusuf onye nke akpọghachiri n'ọrụ. Ma ka o si na dị, e cheghị na mkpọghachi ya ga-egbochi nyocha ọbụla."" ""Na akpọghachiri n'ọrụ apụtaghị na EFCC agaghị aga n'ihu na nyocha ya.""" afirika-55180404,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55180404,"Voting in Ghana: Nana Akufo-Addo nke NPP, John Mahama nke NDC, onye ga-emeri ntuliaka nke 2020?","John Mahama nke pati 'National Democratic Congress' (NDC) na Onyeisiala Nana Akufo-Addo nke 'New Patriotic Party' (NPP) anatala amụma e buru n'isi ha, nke kwuru na ha ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana a ga-eme n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba 2020.","Onye amụma Nigel Gaisie bụ onyeisi ụlọụka a kpọrọ 'Prophetic Hill Church', buru amụma maka ya bụ ntuliaka, kwuo na ""mgbanwe na-abịa"". Gaisie a ma ama n'ihi oke amụma ya nke ọ na-akpọkarị ""Jesus agenda"", kwuru sị na ọ bụ Mahama bụbu onyeisiala mba Gana ga-emeri ntuliaka nke afọ 2020 a. Gaisie dere na Facebook ya n'ime ụbọchị ole na ole gara aga sị: ""Ntuliaka 2020 kwesịrị ka e jiri ime mmụọ nakwa ịgbado anya soro ya, ka pati na-ama aka gbado anya sị...*ANYỊ GA-AKỤSASỊ IHE HA JI BIRI* ANYỊ AGAGHỊ AHAPỤRỤ HA ỌCHỊCHỊ ETU AHỤ KA CHINEKE KWURU"". Nkwa onye ndọrọndọrọ kwere Pịa aha onye na-azọ ọchịchị a ka ị hụ njirimara ya nakwa nkwa ọ na-ekwe ndị ọ chọrọ ịchị. John Mahama National Democratic Congress John Dramani Mahama bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Gana ma bụrụkwa onye ọkachamara na mgbasaozi, na odeakwụkwọ a mụrụ n'ezinaụlọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-amasị n'ụbọchị 29 nke Nọvemba 1958. Ahụike Mwulite ihe e ji enyere ndụ aka Agụmakwụkwọ Akụnaụba Nana Akufo-Addo New Patriotic Party A mụrụ William Dankwa Akufo-Addo n'ụbọchị 29 ọnwa Maachị, afọ 1944, a zụrụ ya na Accra; ọ bụ nwa Edward Akufo-Addo na Adeline. Onyeisiala Nana Akufo-Addo bụ ọkaiwu na Gana tupu ọ banye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ahụike Mwulite ihe e ji enyere ndụ aka Agụmakwụkwọ Akụnaụba Ọ dọrọ ndị pati na-ama gọọmentị nọ n'ọchịchị aka ka ha kpachara anya, kwuo na ntuliaka a ga-abụ igwe na ọbara. Onye amụma Gaisie na-ahụta na ndị NDC ga-emeri ntuliaka a, mana pati nọ n'ọchịchị bụ NPP agaghị achọ ịpụ n'ọchịchị. N'ebe mbido afọ a, o buburu amụma na Donald Trump ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka nke ugboro abụọ n'afọ 2020. Onye amụma kwuru na Akufo-Addo ga-emeri Mana, Reverend Owusu Bempah bụ onye ụkọchukwu ọzọ kwuru na Onyeisiala Akufo-Addo ka ga-azọta oche ya ọzọ ma chịrị gaa n'ihu. N'ịsa ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ Net2TV gbara ya, Bempah kwuru sị na Onyeisiala Akufo-Addo bụ onye na-efe ọkọlọtọ NPP, ga-emeri ntuliaka 2020, ma kwuo na amụma ọbụla na-ekwu na ọ bụ Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha. ""Eji m obi umeala na-agwa ndị Gana ka ha mara na ihe m hụrụ bụ na Nana Addo ga-emeri ya bụ ntuliaka. Mgbe ọ dị ka o ruwela oge ntuliaka oche ahụ kwesịrị ịtọgbọrọ chakoo n'ihi na ndị a na-achị na-akwado ịhọrọ onye ga-achị ha, mana nke Gana atọgbọghị chakoo, onyeisiala ka nọ n'elu ya."" O kwuru sị na amụma ndị ọzọ ndị ụkọchukwu na-ekwu na John Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha. ""M na-ekwu naanị ihe a e kpugherela m"", ka o kwuru. N'ime ihe niile a, amụma ndị a abụghị ejechaa ọ gwụ, dịka ndị Gana na-akwado ime ntuliaka ụbọchị Mọnde bụ asaa nke ọnwa Disemba, ebe ha ga-ahọpụta onye ga-emeri na onye ga-abụ onyeisiala mba ha, nke a ga-edu n'iyi ọrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị. Akụkọ ga-amasị gị: 'Ihe ọyị m nwaanyị gwara m mere m jị ṅụọ iyi na m ga-abụrịrị mmadụ dịka onye ngworo'" afirika-44996571,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44996571,Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.,Ịgwa Nshị bụ omenala ndị obodo Eke n'Enugwu steeti na-eme otu ugboro n'afọ iji were cheta mmeri ndị nna nna ha meriri ndị agbata obi ha na-agha.,"Ihe e ji eme ya bụ mmemme Igwa Nshị bụ ịkụ nnukwu Igba nke a na-akpọ Abia Nshị. Onye Eze na-achị obodo Eke bụ Igwe Harry Onuoha kọwara na oge ochie, ndi Eke na eji ọgwụ na iku egwu were na emenye ndị agbata obi ha dịka Ebe, Abor na Ngwo egwu. Nrị e ji eme ya bụ Igwa Nshị bụ nanị Ọkpa. Ndị Eke na-esi ya bụ ọkpa n'ụdị pụrụiche, ha sichaa ya, ọ na acha ọcha. Ha ewerezịa akwụkwọ nrị na ngwa ndị ọzọ gwọọ ya. Ụzọ ọkpa atọ ndị Eke na-esi bụ ""Ikpo Nkiịtị"", ""ite na-esi onwe ya"" na ""Emeghi eme"" Igwa Nshị ndị Eke na-ewe ụbọchi atọ: ụbọchị ịkụ abịa, ụmụnwoke na ụmụnwanyị na-ezukọ n'ọgbọ ịkụ Igba site n'ụtụtụ rule n'abalị. Otụtụ ndị Eke dika Felix Mgbo kwuru na ịgwa nshị abụghịzị ihe igwọ ogwụ dika ndị mgbe ochie, kama na e jizi ya ekpokọ ndị Eke niile ọnu. Lee ka mmemme Igwa Nshị nke afọ a siri mee n'Eke. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-53227448,https://www.bbc.com/igbo/media-53227448,Ohaneze Ndigbo: Ọ bụ eziokwu na otu ọzo ekewapụla onwe ha n'Ọhaneze?,Dịka akụkọ na-ekwu na e nwere otu ọzọ sị n'otu Ohaneze pụta.,"Otu n'ime ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ohaneze bụ okaịwu Emejulu Okpalaku tinyere ọnụ na ya bụ okwu. Nke a bidoro mgbe mmadụ asaa gara na ngalaba na-ahụ maka ịdebanye ụlọọrụ na otu bụ Corporate Affairs Commisiion were debanye aha otu nke ha kpọrọ Ọhaneze Ndị Igbo General Assembly. Nke a butere kepukepu na e nwere nsogbu n'Ohaneze nke kpatara otu a ji kewapụ onwe ha. Kama okaiwu bụ Emejulu Okpalukwu kọwara ihe butere ya bụ nghọtahie. Ọ kọwara na-e nwere ọtụtụ ngalaba na otu ọzo no n'ime Ọhaneze. Ọ kọwakwara na idebanye otu a na nke ngalaba CAC bụ ka ha nwee ike rụọ ọrụ ha nke ọma. Okpalaku kwuru si ""ọ bụ ndị na-achọghi ọ dị mma ndi Igbo na-ebu akụkọ a""." egwuregwu-49021373,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49021373,Nigeria vs Tunisia: Super Eagles anacharala Tunisia ọlanchara,Naịjirịa abụrụla ndị ga-erite ọlanchara nke Africa Cup Of Nations (Afcon) nke afọ 2019 site n'otu goolu Odion Ighalo nyere.,"Nke a mere ya ugboro asatọ Naịjirịa na-erite ọlanchara n'asọmpi Afcon. Ighalo gbara aka ahịa dịka onye Tunishia nyere ya ""nri chinyere"". Goolu a banyere na nkeji atọ e ji malite ọkara nke mbụ, ka Moez Ben Cherifia mara ụkwa n'ihu poostu ha. Nke a emeela ka Ighalo bụrụ onye kacha nye goolu n'asọmpi a, nke bụ na ọ ga-enweta akpụkpọụkwụ ọlaedo ma ọ bụrụ na enweghi onye ọzọ nyekarịrị ya. O nyela goolu ise n'asọmpi Afcon 2019 a. Nke a bụ tinyere goolu asaa o nyere mgbe Naịjirịa ka na-agba asọmpi iji tozuo bịa asọmpi Afcon. E ji Victor Osimhen tichie Odion Ighalo dịka ọ zọghiere ụkwụ ma merụọ ahụ. Ka e bidoro ọkara nke abụọ, ndị Tunishia chị ọkụ bịa, na-agba Naịjirịa ihe a gbachatara. Mana Firas Chaouat riwara agba ka o rutere n'ihu poostu Naịjiria na nkeji 48. Ị kwadoro ndị Super Eagles nke Naịjirịa dịka ha zọrọ inweta ọlanchara n'asọmpi Afcon? Ụfọdụ ndị chị obi n'aka na-ele ka ha mara ma Naịjirịa ọ ga-eme ha obere obi aṅụrị ka ha a ga-eji iru uju laba ụra, mana Naịjirịa nyere ha ihe mere ha obi ọma. John Mikel Obi so na ndị mbụ gara nata ọlanchara nke ya, dịka ọ bụ ikpeazụ ọ ga-eso Naịjirịa gaa asọmpi. Lee ihe ndị mmadụ kwuru na Twitter ka Naịjirịa merichara: Ndị @CAF_Online bunyere ha ụkpa ekele. @NGSuperEagles kelere ndị Naịjirịa maka ikwado ha ka a na-agba asọmpi a. @Omojuwa kọwapụtara ugboro ole Naịjirịa riterela ọlanchara n'asọmpi a. @oluwashina kwuru ugboro ole Naịjirịa natara ọlanchara a. Lee etu e si gbaa egwuregwu a. Akụkọ ga-amasị gị: 'Mgbe ihe dị mma anyị na-enweta N2000'" afirika-45197625,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45197625,America: Ihe mere Obodo ahụ anaghị enye visa n'Abuja ugbua,Onyeọbụla na-aga njem na mba Amerika anaghị enwe ike ị nweta akwụkwọ ikike ị bata ala ahụ ugbua n'Abuja makana ha emechiela ụlọọrụ na-ahụ maka ya.,"Akwụkwọ njem Naịjirịa na-anọru afọ isi Onye ntaakụkọ BBC nọọ n'Abuja zitere ozi na ọtụtụ ndị mmadụ kwụụ n'iro, n'eche ka ha gbọbata ha, gbara aka laa makana onweghị onye biara ọrụ taa n'ụlọọrụ ahụ. Ụlọọrụ a akpọrọ ""US embassy consolate"" dị na Naịjirịa na Bekee dere akwụkwọ ozi na websait ha, ka onye ọbụla na-achọ akwụkwọ ikike ị ga njem n'ala Amerika gawa Legos maka ị nata yabụ akwụkwọ. Ha kwuru na mmechi a ga-abụ nwantịtị ụbọchị mana ha ekwubeghi oge ha ga-emepe. Ha kwukwara na ha-zipuru ozi a n'igweozi' nke bekee kpọrọ 'email' maka mkpebi a ha mere. Amerika were udi ụlọọrụ a n' Abuja na Lagos Mana ọtụtụ ndị mmadụ onye ntaakụkọ BBC gbara ajụjụ ọnụ taa na Abuja kọwara na onweghị ozi ọbula ha nwetere maka mkpebi a. Otu n'ime ndị a achọghị ka anyị kpọ aha ya gwara BBC na ya sị Legos bịa Abuja maka akwụkwọ ikike a. O kwuru na: ""Ihe kachasị ewute m bụ na ekpofuru m ego n'ụlọ oriri, cheta kwa na ahụhụ di ugbua na Naịjirịa onye were udi ego a? Gịnị mere ha ezipughi akwụkwọ ozi a n'oge?"" O kwukwara na ọtụtụ ndị biara ụlọọrụ a taa sị Akwa-Ibom, Kano, Calabar nakwa ọtụtụ ebe tere aka n'ala Naijirịa. Otu nwa agbọghọ kwuru na mkpebi a ga-emebi ọtụtụ ihe na akwụkwọ ya makana echi ka ụlọakwụkwọ ya ga-emepe n'Amerika. Ọ na-ebe akwa na ọ maghị ihe ọ ga-eme ugbua. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-43610013,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43610013,Ndị ụka Kraịst na-eme emume Ista,Ndị otu kraịst n'ụwa niile na- eri oriri Ista iji wee nwee aṅurị na Jeso ebiligo n'ọnwụ.,"Ụkọchukwu nke ukwu bụ Callistus Onaga Ọtụtụ ụlọụka dị icheiche jị ụka pụrụ iche na-emerube ya bụ Ista. Na Holy Ghost Cathedral Church dị n'Enugwu ka onye isi nchụaja n'Enugwu Katọlik Diocese bụ Bishop Callistus Onaga, kpọrọ oku ka ndị otu kraịst nwee olileanya na otee aka ọ dị njọ, emesia ọ ga-adị mma. Onaga kwuru na ndụ Jeso biri n'ụwa na-egosi anyị na ị nwe okwukwe, ndidi, nakwa olileanya n'ebe chukwu nọ, dị ezigbo mkpa. O kwuru na Jeso tara ahụhụ, nwuọ ọnwụ n'elu obe ma merie ọnwụ tata wee kuziere anyị na onye kwudosiri ike ga-enwe mmeri. Na ya bụ ofufe nru ka bishop Onaga nọrọ gọzie ndị na-anata oriri izizi ebe ndị ụka jikwa imụnye kandle wee gosi na Jeso bụ ihe, emeriela ọchịchịrị site na mbilite n'ọnwụ ya. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45554865,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45554865,Enugwu: Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe maka ụkọchụkwụ a nwụchiri,"Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu agọọla na nwụchị ndị uweojii nwụchiri Reverend Kenneth Okafor nke Emmanuel Methodist Church, Ogbozinne Akpugo na steeti ahụ abụghị iji gbochie ya ịgba akaebe.","Kama ọ bụ ndị uweojii pụrụ iche na-ahụ maka iji egebe ezu ohi nke a kpọrọ FSARS ngalaba nke Legos kpụrụ ụkọchukwu ahụ n'okwu gbasara ogbugbu Igwe obodo ahụ bụ Steven Nwatu. Ụmụnwaanyị obodo Ogbozinne Akpugo dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West n'Enugwu steeti mere ngagharịiwe igosi iwe ha na nwụchi ndị uweojii nwuchiri ụkọchukwu obodo ha n'ime ụlọụka ụbọchị Fraịde. Akpugo dịzị oyi ugbua - Ebere Amarizu Ụmụnwaanyị ndị a mere ngagharịiwe boro ndị uweojii ebubo ịnwụchi ụkọchụkwụ ahụ iji mee ka ọ ghara ịza oku kọmiti gọọmentị steeti hibere maka ilebanye anya na ogbugbu Igwe kpọrọ ya. Okoroọbịa na ndị ụmụnwoke okenye agbala ọsọ n'obodo a Na nkọwa ya, Amaraizu kwuru na ""A nwụchiri ya maka aka ya ịdị n'ogbugbu Igwe Stephen Nwatu nke Ogbozinne Akpugo. ""Ọ bụ ndị SARS si Adeniji Adele na Legos ji okwu ahụ. Ọ na-enyere ha aka na nyocha ha na-eme."" Okafor kwesiri ịpụta ịgba akaebe n'ihu kọmịtị gọọmenti Enugwu steeti hibere ilebanye anya na nsogbu ogbugbu e gburu igwe mana o nweghị ịke ịza oku ahụ. Cheta na, ọnwa ole na ole gara aga, ndị obodo ahụ tigbuchara Igwe maka iji ụgbọala ya kụtuo otu onye. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45541160,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45541160,Ihe mberede okporoụzọ n'Awgu ataala isi mmadụ anọ,Mmadụ anọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere n'ụzọ Nkwe/Ezere nke dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ n'Enugu Steeti.,"Ifeanyi Okorie Onye na-akwọ ya bụ ụgbọala bọsụ na ụmụnwaanyị abụọ ndị so eme njem ahụ nwụrụ anwụ. Ka ọ dị ugbua otu onye n'ime mmadụ abụọ fọrọ ndụ anwụọla fọdụ naanị otu nwoke nọ n'ụlọọgwụ n'Awgu. Ndị uweojịị na nke a mere ya isi mmadụ anọ lara na ya bụ ihe mberede okporoụzọ taa. Ndị hụrụ etu ihe a si mee na-akọwa na ụgbọala ahụ kpọpụrụ dịka njikwa ya bụ 'Break' na Bekee mebiri na-enweghizi ike ijikwa ya bụ ụgbọala. Ndị ahụ kwuru na ya bụ ụgbọala jiri ike kpọba isi na ndagwurugwu dị n'ụzọ ebe ahụ we kwọrie. Ihe mberede okporoụzọ Onye uweojii na ahụ maka ụgbọala na-eme njem n'ogbe ahụ bụ Eze Chikwado kpọpụtara aha ndị ahụ lara mmụọ n'ebe ahụ. Ndị ahụ bụ Josiah Udeh (okwọụgbala ahụ), Clara Awiza, Uzoma Obi na Ifeoma Ilegbunam bụ onye nwuru n'ụlọọgwụ Eagle Hospital nke dị n'Ọgwụ. Ka ọ dị ụgbụa onye ọrụ BBC bụ Chiagọzie Nwonwu nọ na ya bụ ụlọọgwụ sị na onye fọrọ ndụ ebe ahụ ugbua bụ nwanwoke bụ onye na-enyere ọkwọụgbọala aka aha ya bụ Ifeanyi Okorie nọ na agbata ọnwụ na ndụ. Ihe mberede okporoụzọ Onweghị onye na-enyere ya aka maka na dọkịnta ụlọọgwụ ahụ bụ Dkt. Kalụ anọghị nsọ. Chiagozie hụrụ na Ifeanyi gba ọtọ n'akwa ụlọọgwụ ebe ahụ ya na mmiri ọgwụ 'Drip' e tinyere ya n'ahụ. Chiagozie kwuru na ""Onweghị enyemaka ọzọ a na-enye ya nke bụ na ọ nwere ike ịnwụ maọbụrụ na ọbara n'agba ya n'ime ahụ"". Ifeanyi Okorie Ndị ụlọọgwụ ahụ jụkwara na Chiagozie agaghị ebupu ya bụ nwaamadị n'ụlọọgwụ ibuga ya ebe ọzọ a ga-eleru ya anya nke ọma. Onye uweojii bụ onye gara ebe ihe mere si na ọ bụ ndị obodo gbaara ya ama a tupu ya gbagawa ya bụ ebe ahụ. Sagenti Eze Chikwado sịkwa na ọbụghị taa bụ mbụ ụdị ihe na-eme n'ụzọ ahụ. Kama ọ sị na ihe bụtere nke a bụ na ""ya bụ ụgbọala bọsụ bụ ndị ahụ akaala ezigbo nka nke bụ na ọ kwesikweghị ịna agba n'ụzọ, tinyere na o bu ibu karịrị ya"". Ụzọ sị Nkwe gawa Awgu Sagenti Eze sị na o teela gọọmenti kwebere nkwa imezi ya bụ ụzọ mana onwebeghi ihe e mere na ya, agbanyeghị isi mmadụ ya bụ ụzọ na-ata kwa izu. Ọ sị na ya bụ ụzọ nke gara n'etiti ugwu mere ka ọnaaghịa ọtụtụ ụgbọala ahụ ịrị maọbụ rịdaa ya bụ ugwu ọkachasị ụgbọala na-ejicheghị ahụ. Eagle Hospital Awgu Ozi na-eru aghị ntị ugbua kwuru na ndị nwee ndị ahụ nwuru anwụ abịala na Eagle Hospital ha ndị be Ifeanyi bụ onye nke ka dị ndụ. Ndị uweojii sị na ihe ha jiri bute ndị ahụ n'ụlọọgwụ ahụ bụ makana ọbụ naanị ya bụ ụlọọgwụ bụ ụlọọgwụ dị na Ọgwụ bụ nke nwere ike ịnabata ndị ọrịa na-anaghị ego ọbụla. Ka ọdị ụgbụa Ifeanyị amalitele ịnata ọgwụgwọ n'aka dọkịnta ya bụ ụloọgwụ." afirika-49480721,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49480721,Enugu Security: Enugwu enweela kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ,Onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Adamu Mohammed enyela iwu ka Ahmad Abdulrahman were oche dịka Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu steeti.,"Ọ tụgakwara Suleiman Balarabe bụ onye nọbu n'ọkwa ahụ na ngalaba na-eme nnyocha na FCID, Abuja. Nke a na-eme dịka akụkọ nsogbu ogbugbu mmadụ, ntọ na mpụ ndị ọzọ na-arị ibe ya elu na Enugwu steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba bụ onye gbara ama nke a n'ozi o binyere aka ụbọchị Tuzde, kwuru na Mohammed nyere Abdulraham iwu ka o tinye n'ọrụ amamihe o nweterela n'ọrụ uweojii nakwa nnyocha were hazigharịa usoro nchekwa nke steeti ahụ. Tupu e nye ya ọkwa ọhụrụ a, Abdulraman bụbu kọmịshọna ndị uweojii na-ahụ maka ngalaba nnyocha na FCID, Abuja. Ọ rụọla ọrụ dịka Kọmịshọna uweojii na steeti dịga ichiche dịka Kaduna, Bayelsa nakwa Ekiti. Cheta na a tụtaburu Suleiman Balarabe dịka Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti n'ọnwa Febụwari afọ 2019 dịka a na-akwado ntuliaka 2019. Ndị uweojii nwuchiri Biodun Fatoyinbo nke COZA Biodun Fatoyinbo Dịka ọ dị ugbua, Biodun Fatoyinbo nke COZA no n'aka ndi uweojii ebe ha na agba ya ajụjụ. Ndị uweojii gara n'ụlọ ya were nwuchie ya. Cheta na Busola Dakolo bụ nwunye otiegwu Timi Dakolo boro ya ebubo mwakpo. Akụko ka na-abia . . . Nwa Sirleaf ọ ga-aga mkpọrọ? Charles Sirleaf bụ nwa Ellen Johnson-Sirleaf onye bụbu onyeisiala mba Liberia, ekwuola na aka ya dị ọcha n'ihe gbasara ebubo imefu ego ala ha ruru ijeri kwuru ijeri dọla, e boro ya. A nwụchiri ya n'izu gara aga dịka e kwuru na ego ruru ijeri dọla otu narị na anọ furu n'akpaego ụlọakụ etiti Liberia nke ọ bụbu osote gọvanọ ya. N'egwuregwu, Flying Eagles nke Naịjirịa ji goolu ise a satara anọ na penariti 'gbaa ka anyị laa' merie mba Malị iji banye n'agba ngwụcha nke asọmpi 'African Games' a na-eme na mba Moroko. Central Bank na ndị ji ha ụgwọ achụwala ndị ji ha ụgwọ Ụlọọbaego etiti bụ Central Bank nke Nigeria nakwa ụlo orụ ndi ọzọ na-ebinye ego enweela nkwekọrịta na isi n'ọba ego ndị ọzọ ndi mmadụ ji ha ụgwo nwere weghara ego niile e ji ha. Ha kwuru nke a n'ọgbako ha nwere na Legos n'ụbochi Monde. Dịka nkwekọrịta ahụ si dị, onye ọbụla chọrọ ibite ego ga-binye aka n'awụkwọ ma kwenye ka e si n'oba ego ọzọ o nwere weghara ego ahụ ma ọ bụrụ na ọkwughị ya n'ọge. Ya bụ na onye ji ọbaego 'A' ụgwọ, e nwere ike isi n'ọbaego 'B' weghara ego ahụ ma ọ bụrụ na o nwere ego ebe ahụ. A ga-eme nke a site n'akara ""Bank Verification Number"" bụ nke jikọrọ akara ọbaego niile mmadụ nwere. Iwu gbasara inye Mita ọkụ latrịk Ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik bụ 'National Electricity Regulatory Commission' (NERC) enyela ụloọrụ niile na-ekesa ọkụ latrik iwu itinye meter n'ụlọọrụ gọomenti niile dị na Naijiria. NERC nyekwara ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik ikike ichabi ọkụ latrik nke ụlọọrụ Gọomenti ọbụla ji ha ụgwọ. Ha nyere ruo ọgwụgwụ ọnwa Ọgọstụ 2019 itinye metre ndị a. Kenya na-erezi mmanu agbidi Kenya na-atu anya imipụta mmanụ agbidi ruru ""100,000 barrels"" kwa ụbochi bido n'afọ 2022 Mba Kenya esorola na mba na ere mmanụ agbidi na Afríka. Ụlọọrụ Chemchina nke dị na UK bụ ndị mbụ zutara mmanu agbidi ruru barrel puku narị abụo na iri anọ (240,000 barrels). Kenya na atụ anya irite uru nde dolla iri asatọ na anọ n'ime afo abụo site na ire mmanu agbidi. A na-atụkwa anya na mba Kenya ga-erite ihe ruru nde dollar iri asatọ na anọ ($84m) n'afọ abụọ na-abia abịa. Ụgbọ ahapụla Blessing Okagbare Okagbere bụ onye kacha agba ọsọ na 200m nke ụmụnwanị mba Afrịka Egwu eriala Blessing Okagbare na-agbara Naijirịa ọso dịka a chụpụrụ ya maka echeghị ka egbuo opi tupu ọ gbapụ ọso na asọmpi African Games. Nke a ga-agbawa ndị otu ""Athletics Federation of Nigeria"" obi n'ihi na Okagbere so na ndị a na-ele anya itutere Naijiria ugo n'asọmpị ahụ. Mana nwaada Naijiri ọzọ, Joy Udo-Gabriel, meriri n'ogoogo nke ya iji tozuo oke isonye n'agba nke ikpeazụ n'ọsọ ""one hundre metres"" nke ụmụnwanyị. Naijirịa na agba onye nke isii na African games dika ha ji olaedo ise, ọla ọcha ise na ọla nchara asatọ. Gee nkeji akụko BBC n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụko ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba." afirika-44435387,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44435387,Ndị ndu South na Middle Belt: Wepụ onyeisi INEC,"Ndị ndu mpaghara ndịda, etiti nakwa ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola na egwu na-atụ ha ụlọọrụ INEC agaghị a hazi ntuliaka ziri ezi n'afọ 2019.","Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015 Ha rụtụrụ aka n'oke ịkpa oke na imelara ndị ikwu nke ọchịchị a bụ ihe juputara n'ụlọọrụ a. Ndị ndu a kpọrọ oku ka e wepụ onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu, kwuo na enwere ihe ndị na-egosi na ọ chọrọ ịrụrụ aka na ntuliaka i ji nye onyeisiala Buhari mmeri. Ndị ndu tinyere ọnụ n'okwu a gụnyere Edwin Clark na Nkanga Idongesit ndị si ndịda, Ayo Adebanjo nke ọdịdị anyanwụ, Chukwuemeka Ezeife nke ọwụwa anyanwụ nakwa Dan Suleiman nke etiti Naịjirịa. Buhari duru Yakubu n'iyi ọrụ n'ọnwa ọktoba afọ 2015 Onyeisi otu Pan Niger Delta bụ Nkanga Idongesit kwuputara mkpebi ndị ndu a ma kwuo na ndị isi ndị agha Naịjirịa ekwesila ịla ezumike nka mana ha nọ n'ọrụ ugbu a. O kwuru na ndị a niile na-arụ ọrụ n'otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ i ji mee ka obi dị onyeisiala bụ Mohammadu Buhari mma. Idongesit kwuru site n'afọ 1960 rue ugbu a, na ọ bụ naanị Buhari nyerela onye si n'agbụrụ ya ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka. Ndị otu a gara n'ihu kwuo ka onyeisiala nwụchie ndị Fulani na-achị ehi maka ogbugbu ha na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa ma hapụ ikpuchi ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45457701,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45457701,MTN: CBN ewepụla ijeri naira ise ego nha ha dara ụlọakụ,"Ụlọakụ etiti bụ Central Bank of Nigeria(CBN) na bekeee, ewepụla ego karịrị ijeri naira ise n'ego ụlọakụ atọ na Naijiria.","Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria Ụlọọrụ akụkọ Reuters kwupụtara na CBN wepụrụ ego karịrị ijeri naira ise n'ego ụlọakụ Citigroup, Standard Chartered nakwa Stanbic IBTC. Ha kwuru na a napụrụ ụlọakụ CitiGroup ijeri naira 1.2; Standard Chartered ijeri naira 2.4, ebe Stanbic IBTC gwara ụlọ azụmahịa Stock Exchange na a kụpụrụ ha ijeri naịa 1.8. CBN wepụrụ ego a ka ha dachara ụlọakụ anọ nha ijeri naira 5.87 iji taa ha ahụhụ n'ihi aka ha dị n'ebubo na MTN bupụrụ ego na Naijiria n'ụzọ megidere iwu. Cheta n'izu gara aga, CBN dara MTN nha maka ibupu ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri dọla 8.134 n'ụzọ ezighị ezi, ma dakwa ụlọakụ anọ nha maka inyere ha aka mee nke a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50317600,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50317600,Eni Njoku: Gịnị ka ị ma maka nwoke a isi ya na-apụ ọkụ n'agụmakwụkwọ?,"Eni Njoku bụ otu dimkpa Igbo e ji ama atụ onye gbajiri ""chalk"" ma kụwaa ""slate"".","Dimkpa Igbo a bu agụmakwụkwọ n'isi ọ fọzịa obere ka o si ya n'imi na ọnụ na-apụta. Maka ihe ọ gụtara n'akwụkwọ, ọ bụzị onye a na-anụ aha ya na mpaghara Naịjirịa, nke bụ na aha ya dị n'ụfọdụ okporoụzọ nakwa ụlọakwụkwọ. A gụrụ otu ụlọobibi dị na mahadum Legọs aha ya, e nwere ụzọ dị n'Owere, Imo steeti a gụkwara aha ya ma dgz. Ma ruo ugbua, a ka na-eme emume ncheta ọmụmụ ya kwa afọ nke a kpọrọ ""memorial lectures"" na Bekee. Gịnị ka ị kwesịrị ịma maka ya? Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-51263439,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51263439,Okada and Keke: A machiela ọgbatumtum n'ụfọdụ ebe na Legọs,"Gọọmentị Legọs Steeti kwuru site n'ụbọchị mbụ ọnwa Febụwarị, 2020 na ha amachiela ọgbatumtum na keke ịgba n'ụfọdụ okpuruọchịchị dị na steeti ahụ.","Jubril Gawat bụ onye enyemaka gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na mgbasa ozi ọhụrụ kwuru nke a n'ihe onyonyo o wepụtara na twitter. Ọ sị na mmachị a ga-emetụta ndị ọrụ ọgbatumtum dịka Gokada na Opay. Gawat sị na ọ bụ maka ọgbatumtum na keke nweghizi nchekwa ugbua na gọọmentị ga-ewepụta ụgbọala ọhụrụ ga-anọchi anya ha. Ebe ndị o metụtara gụnyere; Apapa, Iganmu, Surulere, Itire, Coker-Aguda, Ikeja, Onigbongbo, Ojodu, Eti Osa, Ikoyi/Obalende, Iru, Victoria na Lagos Island. Ụlọikpe ejirila nde naịra iri tọhapụ Shehu Sani nwamgbenta Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja sị na Shehu Sani nwere ohere ịla be ya ma ya kwụọ nde naịra iri dịka ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpọ ha bịa zute ọkaikpe Inyang Ekwo. EFCC na-ebo Sani ebubo abụọ banyere nrụrụaka. Ha sị na Maazị Sani natara dọla puku iri na ise n'aha onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu. EFCC sịkwa na ọ natara dọla puku iri n'aka mmadụ n'ụzọ akwụghị ọtọ. Maazị Sani sị na ya emeghi ihe a ụlọọrụ EFCC na-ebo ya. Ọ bụ n'ọnwa Febụwarị ka ọ ga-alaghachi ụlọikpe ị zara ọnụ ya. Ọ bụ kamgbe ọnwa Disemba ka Sani nọ n'aka ha. A ga-egbu Maryam Sanda, nwaanyị gburu di ya - Ụlọikpe Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja amaala Maryam Sanda ikpe ọnwụ maka ogbugbu di ya bụ Bilyaminu Bello. Ọkaikpe Yusuf Halilu kpebiri nke a n'ụtụtụ Mọnde bụ ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Janụwarị 2020. Sanda pụtara ịzara ọnụ ya maka ebubo na o ji mma magbuo di ya n'afọ 2017. Ndị uweojii kpụpụrụ ya ụlọikpe ma sị ka a maa ya ikpe ọnwụ dịka ha sị na ọ ma ama gbuo di ya. Sanda na onwe ya sị na aka ya dị ọcha n'ebubo e boro ya. Ikpe a gara n'ihu ruo afọ tupu e ruo mkpebi a. Mmadụ ise anwụọla na mwakpo Gwoza Ọnụọgụgụ ihe nwụrụ na mwakpo a wakporo ụlọalakụba dị n'obodo Gwoza dị na Bọrnu steeti, eruola mmadụ ise. Ndị nwụrụ gụnyere mmadụ abụọ yi ogbunigwe n'ahụ na mmadụ atọ ndị bịara ekpere. Grammy 2020: Angelique Kidjo sepụrụ Burna Boy wee nara ihe nrite nturuugo Grammy Angelique Kidjo bụ otiegwu a ma ama sepụrụ Burna Boy nke Naịjirịa ọnụ n'ara site n'irite nturuugo Grammy n'ogogo a kpọpụtara aha ha abụọ na mmadụ atọ ndị ọzọ. Kidjo ji 'Celia' rite nturuugo 'ọbaegwu kachasị mma na mbaụwa'. N'aka nke onwe ya, Kidjo ji ohere inye ekele wee sị na ọ na-akwanyekwara Burna Boy ugwu maka na o so na ndị na-etolite ga-eme ka anya ụwa tọ n'egwu Afrịka. Coronavirus ka na-egbu na-aga: Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirus si na Chaịna malite ataala isi mmadụ iri asatọ na otu ebe ihe ruru mmadụ puku atọ ka bu ya bụ ọrịa. N'ihi nke a, mba Chaịna eyigharịala ụbọchị ha kwesịrị ime emume mmalite afọ ọhụrụ ha, bugazie ya ụbọchị ụka na-abịa. Akwa ka na-ahịọ n'isi Kobe Bryant Ndị mmadụ ka na-eru uju maka ọnwụ Kobe Bryant dịka a na-enyocha ihe mere ka ụgbọelu helịkọpta ya na mmadụ asatọ ndị ọzọ nọ n'ime ya si n'elu dapụ ma kpọkasịa. Ndị gụnyere Onyeisiala Donald Trump, Barack Obama chịbụrụ Amerịka, C. Ronaldo, Messi, Mo Salah na ndị ọzọ, so na ndị kwuputarala mwute ha maka ọnwụ ya. Coronavirus oruola Afrịka? Ndị mba Aịvọrị Kost ekeela nkwụcha dịka otu nwata akwụkwọ si mba China lọta na-egosi ihe mgbaama na o nwere ike ibu ọrịa Coronavirus. Mba Aịvọrị Kost edopụla nwata akwụkwọ a otu ebe ma na-eche mpụtara nnyocha ahụ ya. Ọ bụrụ na a chọta ọrịa a n'ahụ ya, ọ ga-abụ onye mbụ n'Afrịka a ga-achọta ya n'ahụ ya. Cheta na Coronavirus a egbuola ihe ruru mmadụ iri asatọ na mba Chaịna. Buhari agwala ndịagha ụgbọelu gaa bido ịlụ agha n'Ugwu Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela ikike ka ndịagha ụgbọelu nke Naijirịa tinye aka imegide mkpamkpa ndị omekome na-akpa na mpaghara Zamfara, Kaduna na Naịja steeti. Buhari o ga-enwe ike merie Boko haram? Dịka ọ dị ụgbu a, ndịagha ụgbọelu Naijirịa ehiwela ụlọọrụ na Minna ma kwuo na ha ga-ebido iwakpo ndị omekome a ozugbo ozugbo. Naịjịrịa ga-ebi Chaịna ego: Naijirịa ga-ebite ijeri dollar abụọ na ọma n'aka china nke ha ga-eji rụọ igwe na-eji ikuku agbịdị emepụta ọkụ Latrik. Ha ga-ebido ịrụ ya bụ igwe na emepụta ọkụ Latrik nke ga-adị na Abuja,Kano na Kadunna steeti n'ọnwa Aprel ma na atụ anya na ịgwe a ga-ebulite ike ọkụ latrịk Naijiria rụọ mega watts puku iri. N'Egwuregwu Dịke ama ama na boolụ nkata bụ Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị nwụrụ n'ihe mberede ụgọelu n'Amerika. Kobe Bryant na Gianna nwa ya nwaanyị Ọ bụ ihe mbere ụgbọelu gburu ya na nwa ya nwaanyị bụ Gianna na mmadụ asaa ndị ọzọ. Bryant gbara afọ iri anọ na otu tupu ọ nwụọ. Lee ka ndị amaama sị ebe akwa arịrị maka ya ebe a: Gụọ ihe ị kwesịrị ịma maka ya ebe a: Ihe asaa ị kwesiri ịma maka Kobe Bryant Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-44255157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44255157,Nwoke metọrọ ụmụnne anọ sị na ọ bụ ekwensu,"Onye ọkaikpe, Zinnah Alikor nke ụlọikpe nta dị na Pọt Hakọt atụnyela otu nwoke gbara afọ 41 na nga maka ịmetọ ụmụnne anọ.","Okenye imetọ ụmụaka ụmụ nwanyị na-arị elu ugbua A na-ebo nwoke ahụ a kpọrọ Michael Isaiah ebubo iwakpo ụmụnne anọ dị afọ abụọ, asaa na iri na asaa. Alikor, onye kwuru na ihe nwoke a mere bụ 'arụ ka arụ' kwuru n'okwu ahụ karịrị ụlọikpe ya ma nye mkpebi ka a tụnye nwoke ahụ na nga rue oge onyeisi ngalaba na-ekpe mmadụ ikpe (Director of Public Prosecution ) nyere ndụmọdụ n'okwu ahụ. Mgbe a jụrụ ya, Isaiah sịrị na 'ọ bụ ekwensu nunyere' ya na ya ejighị anya ya. N'otu aka ahụ, ndị uweojii na Legos na-enyocha otu agadi nwoke dị afọ 73 maka ebubo imetọ nwa dị 14 ma tunye ya ime. Nwoke ahụ onye bụ ọkwọụgboala 'taizi' bị n'Agric, Ikorodu bụ agbataobi nne nwata ahụ ọ tụrụ ime. Dịka ndị uweojii nọ na Legos siri kọwaa, agadị nwoke ahụ na-ezigakarị nwata ahụ ozi , nke nne nwa ahụ amaghị na ihe so ya. Kọmishọna ndị uweojii bụ Imohime dọrọ nne na nna aka na ntị ka ha kpachapụ anya mara ndị ha na nwa ha na emekọrịta iji gbalahụ ụdị ihe a. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53047794,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53047794,Herpes: Mata maka ọrịa nwerike ibute kansa akpa nwa.,Akụkọ na-ekwu na otu nwoke akpọgala otu nwaanyị ụlọikpe maka na ọ gwaghị ya na ọ nwere ọrịa Herpes tupu ha esusuo ọnụ.,"Nwoka a gbara agwụrụ na nwaanyị a ga-akwụ ya $236,000 maka ihe niile ọ gabigara kemgbe ọ sị na nwaanyị a bunyere ya bụ ọrịa. Nwoke na-ekwu na otu ihe ga-akacha eri ya ego bụ ọgwụgwọ ya nke ọ sị ga-eri ya $181,700. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jị ajụ sị , ""Gịnị bụ ọrịa herpes a?"". Anyị kpọtụrụ dọkịta Prince Akahara ka ọ gbaa anyị ọgba n'eze maka ọrịa coronavirus. Gịnị bụ Herpes? Herpes bụ ọrịa a na-ebute site na mmekọ ahụ nke gụnyere nsusu ọnụ na mmekọ nwoke na nwaanyị. Herpes dị ọtụtụ nke gunyere ""Herpes Simplex virus type 1 (HSV-1) na ""Herpes Simplex virus type 2 (HSV-2). Anaghị agwọ ọrịa herpes agwọ nke mere na ọtụtụ ndi mmadụ ji atụ ya egwu. I jị maa atụ , HSV-1 na-emekarị n'ọnụ ebe HSV-2 na-eme n'ike, ọtụ maọbụ amụ. Kama onye bụ HSV-1 metụ amụ maọbụ ike na ọtụ mmadụ, onye ahụ ga-ebute HSV-1 n'ene ndị ahụ. Nke ọzo bụkwa na mmadụ were ọnụ ya metụ onye bu HSV-2, HSV-2 ga-eme ya n'ọnụ. Ihe ndị WHO na-ekwu maka Herpes? Ndị ngalaba WHO ekwuola na mmadụ ijeri atọ na ụma na erubeghị afọ iri ise bụ HSV-1 na mba ụwa niile ebe mmadụ nde narị anọ na iri itolu na otu dị ihe dịka afọ iri na ise ruo afọ iri anọ na itolu bu HSV-2. WHO kwukwara na onye nwere HSV-2 kacha nwee ike ibute ọrịa obirinajaọcha (HIV). Ha kwukwara na onye nwere ọnye sitere na HSV-1 agaghị enweta ya bụ ọrịa na akụkọ ike ya. Na-agbanyeghị na ọ naghị emekarị, kama nne nwereike ibunye nwa ya ọrịa herpes mgbe ọ na-amụ ya. Herpes nwereike ị nọ n'ahụ mmadụ ọtụtụ afo ma onye ahụ agaghị amata. Kedụ etu ị ga-esi ebute ọrịa Herpes? Herpes kacha efe mmadụ site na mmeko ahụ di iche iche. Kama onye bụ ọrịa herpes metụ ọnya, ọkọ ahụ maọbụ ebe ọkụ gbara ahụ mmadụ, onye ahụ nwereike ibute ọrịa Herpes. Ụzọ ọzọ bụkwa na onye metu ọnye herpes aka ma were aka ahụ metụ onwe ya n'ọnụ, ike n'akụkụ dị ya nsọ maọbụ anya, onye ahụ nwereike ibute ọrịa herpes. Eziokwu bụ na ọbụghị iwu na mmadụ ga-edina mmadụ tupu o bute ọrịa herpes. Ụfọdụ ndị na-ebute ya bụ ọrịa site mgbe okenye dịka nne maọbụ nna nwere Herpes nke ọnụ susuru her ọnụ, her nwereike ibute ọrịe herpes nke ọnụ. Ọ bụghị kwa iwu na mmadụ ga-ahụ ọnya tupu ị mara na ị bu ọrịa Herpes n'ihi na onwere ike izo n'ahụ mmadụ. Ihe Dokita Akagharasị mmadụ niile kwesiri ị mata maka ọrịa Herpes. Dọkịta aha ya bụ Prince Akahara kwuru na nje Herbes nwereike ị nọ n'ahụ gị ma o nweghị ihe ọ ga-eme gị. Ọ kọwara na ọ dị ebe niile n'ụwa. Akahara kwuru na nke kacha dị kwa ire bụ HPV-6, HPV-12 na HPV-8 nke nwereike ibute ọrịa kansa nke akpanwa kama enwere ọgwụ mgbochi maka nje ndị nke a. O kwuru sị "" Iyi okpunnabuenyi na-enyere aka igbochi mmadụ ibute nje a mgbe ha na mmadụ na-enwe mmekọ"". Kama ọ kwuru na ihe kachasị mkpa bụ ka ndị mmadụ hara inwe ọtụtụ ndị ha na-enwe mmekọ. Akahara kwuru sị ""ewepụ ndị a m kpọrọ aha, nje Herpes anaghị egbu mmadụ"". O kwukwara na dịka ọ bụ dọkịta, na ọ hụla ọtụtụ ndi mmadụ nwere ọnya na mpaghara ike ha maka ya bụ ọrịa ma ha amaghị na ha nwere ya. O kwuru sị ""N'ime mmadụ otu puku, otu onye nwereike i bu ya"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45261132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45261132,Buhari: Onwe ihe ọ chọrọ ị gwa anyi n'ije a o mere taa?,Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya ka o ji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita narị asatọ taa.,"O rituru sonye ndị ji ụkwụ na-aga maka na ndị na-akwado ya nọchichara ụzọ gbochiri ụgbọala ya igafe ka o si ebe ọ gara ekpere maka Sallah na-ala n'ụlọ ya na Daura. Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchiri Buhari kwuru na ihe a gosi na ọtụtụ mmadụ hụrụ Buhari n'anya na kwa na ihere ga-eme ndị na-ekwu na Buhari emeela agadị. Mana emume a Buhari mere taa na-aga ụzọ abụọ na soshal midia. @Don_Antonio dere na Buhari ji ukwu aga maka uru ọ ga-enye ya n'ahụ, nakwa na ọgaghị akwụsị nsogbu Naịjirịa End of Twitter post, 1 @SundayIwalaiye na-agba ajụjụ na ihe a Buhari mere taa ọ bụ uru Demokraci butere Naịjirịa? @MrIconz na-akụkụ nke ya na-ewe ezigbo iwe na gịnị mere ndị mmadụ ga-apụta na-ekele onye a ji aka ha tinye na-ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala? Mana o nwere ndị ihe a o mere taa na-atọ ka suga. Mmadụ dịka @AbdulkadirWanka dere na twita na ndị mmadụ ihe niile gbasara Buhari na-amasị nke ọma na-atụ anya nke ukwu. @adinoyi123 n'uche ya dere na ezi aha keri akụnaụba. Ọ gara n'ihu kperi Buhari ekpere. Akụkọ ga-amasị gị 'Arịarịa ga-arụkarị China ma ha nwee ohere'" afirika-49489915,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49489915,Relationship redflags: Gbawa ka ụkwụ gị ha ma ị hụ akparamagwa ndị a n'onye chọrọ ịlụ gị,"A na-ekwu n'okwu sị, ""ọ bụghị nwoke niile wa trawụza bụ di""; ụfọdụ ụmụnwaanyị anwụọla n'ihi ịlụ onye na-ekwesịghị ka ha lụọ.","Nke a ebulitela okwu kwa mgbe, ebe ndị mmadụ na-ekwu ihe mere ha ji lụọ onye ha lụrụ maọbụ ihe mere ha ji ghara ịlụ onye ha bubu n'obi. Tupu ndị mmadụ amalite ịyị onwe ha maọbụ kwuwe okwu ịbanye alụmdi na nwunye, ọtụtụ na-akpa nkata banyere ihe dị iche iche gụnyere: Ihe atọ a dị mkpa, mana ọ bụ ya na-eme ka mmadụ mara ma ọ ga-alụ ma ọ gaghị alụ? BBC Igbo jụrụ Obioma Ogakwu bụ ọkachamara n'ihe gbasara nwoke na nwaanyị, kedụ ụdị akparamagwa ị ga-ahụ gbaara onye gị na ya na-ekwu okwu alụm di na nwunye ajọ ọsọ? Ogakwu kwuru sị: ""Ọ bụghị ihe niile bụ maka ego, gịnị ka ị gaghị anabata dịka mmadụ ị bụ?"" ""Onye ọbụla nwere ihe na-eju ha afọ ha agaghị anabata ma onye ọzọ mee ha. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ihe ị na-achọ n'onye ị chọrọ ịlụ bụ ezi akparamagwa, ya bụ na ọ bụghị onye ji ego ga-ebutere gị ụzọ."" Igbo adịghi anabata nwoke na nwaanyị ibi na-alụghị alụ Lee akparamagwa ndị ọzọ Ogakwu kwuru kwesịrị ịchụ gị ọsọ: ""Kedụ etu onye ahụ si eme maka ihe gbasara anamachọọrụ ma ọ bụrụ onye na-enweghi ọrụ?"" ""Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-enwe ego oge ụnụ zutere, mana ọ bụrụ onye na-agba mbọ ma nwee ezigbo nchekwube na atụmatụ, ọ gaghị ebu gị aka makana ọ ga-agbalị hụ na ihe na-aga nke ọma."" ""Ụfọdụ ndị si n'ezinaụlọ ebe ọ bụ nne ha na-akpa nri karịa nna, nwereike iwere ya na ọ bụ nwaanyị ha na-alụ ga na-akpa nri dịka ọ dị mgbe ha na-eto."" ""Ya mere na ị ga-agbado anya tụlee ma ezinaụlọ ya ọ dị etu ahụ, ma ụmụnne ya a na-akpa ụdịrị agwa ahụ ka ọ bụ naanị ya nwere nsogbu ahụ."" ""Kedụ etu o si anabata enyemaka gị? Iwe ọ na-ewe ya na ọ bụ gị na-eweta enyemaka ka ọ bụ ihe ọṅụ nye ya?"" E nwere enyi ya nke ị nwereike igakwuru ka ụnụ abụọ kpaa etu ụnụ ga-esi nyere ya aka? ""Ọ bụrụ na ọ naghị anabata enyemaka, ọ baghị uru na i tinyere isi n'ịyị ya bụ ọyị"". Gịnị kpalitere okwu a? Ihe so kpalite okwu a bụ otu nwaokorobịa kọrọ etu nwaanyị ọ na-achọ ihu ya siri wụọ ya n'ala n'ihi na o jighi ụdịrị ego ọ chọrọ. N'aka ọzọ, otu nwaada kọrọ akụkọ etu daada ya si kwụọ ụdọ ka ọ na-eche ka nwoke ọ lụrụ oge o nweghị ego mechara gbanwee ka ha lụchara ma bido ezinaụlọ. Ajụjụ ọtụtụ ndị wee bụrụzịa ""kedụ nke e mere meta ndị mmadụ?"" Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ezinaụlọ: Onye kachasị emefu ego n'etiti di na nwunye?" afirika-47696860,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47696860,Lagos Trade Fair: O nweghị onye kpọchiri ahịa anyị - Onyeisi Ahịa 'Trade Fair',Onyeisi ahịa Lagos International Trade Fair bụ Tony Obi ekwuola na o nweghị eziokwu dị n'akụkọ na Lehgọs steeti ewegharala ahịa ahụ.,"Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na nwa Ahmed Tinubu, onyeisi pati APC mabụrụkwa eze ahịa niile dị na Legọs steeti bụ Folashade Tinubu Ojo ewegharala Ahịa 'Trade Fair' ma nye iwu ka e mechia ahịa ahụ. Mana na mkparịtaụka Tony Obi na BBC nwere n'ekwentị, ọ kwuru na o nweghị ihe yiri nke a merenụ. Obi sịrị, ""Ọ bụghị eziokwu. O nweghị ihe dị otu ahụ na-eme n'ebe a.Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu Folashade Tinubu Ojo n'okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị. Cheta na izu ole na ole gara aga, ndị ahụ mere ngagharịiiwe iji gọsị na ọ gaghị adị ha obi mma ma gọọmenti etiti nye gọọmenti Legọs steeti ahịa ahụ nke ha gbazirzinyere ndị ahịa afọ 50. Trade Fair: Ọ bụrụgodi na gọọmenti etiti chọrọ ire ọdọ ahịa a, ndị Igbo ga-egonwu ya' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52823798,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52823798,Onweghị mwakpo ndị ọchị ehi anyị ma mere na steeti Ebonyi - Ndị Uweojii,Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola sị na ha amaghị ihe ọbụla gbasara mwakpo ndị ọchị ehi na steeti ahụ.,"Ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị a na-ekwu na-akpa ike dị icheiche BBC Igbo kpọrọ Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ, o kwuru sị na ruo ugbua, na ha anabatabeghi ozi nke ha ji enweta mkpesa ọbụla gbasara mwakpo ndị ọchị ehi. Odah kwuru na naanị ihe nkwafu ọbara merela nso nso a ha ma maka ya bụ otu nwaanyị na nwa ya ndị obodo Agịla gburu ebe ọ gara ịkọ ugbo ya dị n'okeala ebe ndị Benue steeti na Ebonyi na-azọ oke. Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ malitere ifesa akụkọ na ndị ọchị ehi wakporo ma bibie ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti, n'elu soshal midia. Okwu mwakpo ndị ọchị ehi a malitere inwu ọkụ dịka akụkọ pụtara na mmadụ na-eso ụgbọala bu nri na akụrụmgwa ndị ọzọ abata ọwụwa anyanwụ n'agbanyeghị na gọọmentị machiri isi steeti ga steti maka iji gbochie mbawanye coronavirus. Ndị so agbasa akụkọ a bụ ndị otu Ipob dịka onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu na-ekwusi ike na ndị Fulani na-achị ehi na-abịa ọgụ n'ọwụwa anyanwụ. Nchọpụta BBC bụ na ọtụtụ akụkọ mwakpo a na abụ nke metụtara ọgụ a na-anụ kemgbe dịka nke metụtara obodo Agila dị na steeti Benue na ndị Ngbo - dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu - ha na ha nwere oke ala. Ọkwa otu ọchịchị ime obodo Ohaukwu a ka ndị mere ihe onyonyo a dị n'akụkọ a sị mwakpo ha na-egosi mere." afirika-43082882,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43082882,"FA CUP: Iheanacho, Moses, Hazzard, Morata chọrọ ịkwụsị ike",Ọgbọ egwuregwu bọọlụ ga-ekpo ọkụ n'asọmpị iko FA taa.,"Kelechi Iheanacho ba Leicester n'ọnwa Ọgọsụtụ n'afọ 2017 Kelechi Iheanacho bụ onye otu Leicester City bụ onye anya ga-atụkwasị n'asọmpị Leicester City na Sheffield United. Ugbua, Iheanacho enyela ọkpụ anọ n'asọmpị FA n'afọ nke a. N'izuụka gara aga, Manchester City merịrị Leicester city. Ihe a mere ka asọmpị nke taa dị Leicester City ezigbo mkpa. Ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya nwere olileanya na Leicester ga-eji asọmpị nke taa nwe kpanite obi ha maka mmerị ha mmerị ha ụnyahụ. Chelsea ga-atụ Hull City aka n'anya Victor Moses bidoro egwuregwu bọọlụ na Crystal Palace Gụ kwa Oliseh na Fortuna Sittard agbasala Chelsea na Hull City ga-ebido mgba nke ha na nkeji itoolu nke abalị n'asọmpị FA. Moses na Hazzard ga-esokwa na asọmpị taa. Mana Morata sị ezumike mmekaahụ lọta ka anya ga-atụkwasị na asọmpi a. Antonio Conte bụ onye nkwuzị Chelsea ekwuola n'iko FA dịrị ha ezigbo mkpa. O kwuru na ọ bụghị sọọsọ iko Premier League, mọọbụ Champions League ka ha chọrọ. Asọmpị ndị garaaga Arsene Wenger na-ekele ndị otu ha bụ Arsenal maka mmerị ha meriri Ostersunds FK ụnyaahụ. Ha nyere ha ọkpụ anọ mana ha asatara otu. Wenger kwuru na mmeri nke a tọrọ ezigbo ụtọ maka na ọnọdụ yabụ asọmpị bụ UEFA Europa League fịara ahụ. Nacho Monreal bụ onye nyere goolu nke mbu, Sotirios Papagiannopoulos nyere nke abụọ, ebe Mesut Ozil nyere nke atọ." afirika-43307722,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43307722,Naịjirịa na Ghana: Onye ga-enyere ibe ya aka ịlụso mpụ ọgụ?,Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na Naịjirịa ga-enyere mba Ghana aka na-iluso mpụ ọgụ.,"Buhari gara Ghana taa isonye ha na mmemme ncheta ụbọchị nnwereonwe ha Buhari kwuru nke a taa oge ọ gwara ndị Ghana okwu maka mmemme ncheta ụbọchị nnwereonwe ha ha mere taa. N'okwu ya, Buhari kwuru na ya ga-enyere Ghana aka iluso mpụ ọgụ. Mana ajụjụ nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ etu Naịjirịa ga-esi nyere Ghana aka ebe akwụkwọ ndị otu Amnesty International depụtara gosiri na Ghana ka Naịjirịa mma n'ihe gbasara mpụ. N'akwụkwọ nke afọ a, Naịjirịa nọ n'ogo 148 nime mba 180 n'ụwa niile ebe Ghana nọ n'ogo 80. Nke a pụtara na agbanyeghi agha gọọmenti etiti na-ebuso mpụ, Naịjirịa ka nwere mpụ nke ukwu. BBC Igbo gbara onye nnọchi anya otu Amnesty International Auwal Musa Rafsanjan ajụjụọnụ gbasara ihe Onyeisiala Buhari kwuru. Auwal kwuru na mmadụ agaghị enyeli ihe ọ na-enweghi. Ọ kọwara na ọnọdụ mpụ na Naịjirịa nọ n'ogo dị elu, nke a kpatara na ọ gaghị enyenwuru mba ọzọ aka ịchụ mpụ. Gere ihe o kwuru ebe a: Auwal bụ onye nnọchite anya ndị Amnesty International na Naịjirịa Cheta na ndị mba Afịrịka mere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari onye ndu na ibuso mpụ agha maka agha ọ na-ebuso mpụ na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44878670,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44878670,Ịgba onye dị ime akwụkwọ bụ ịgba mmadụ atọ akwụkwọ - Ụkọchukwu,Dayọsịs na-ahụ maka ụka Anglịkan niile nọ n'okpuru Aguata n'Anambara steeti ekwuola na ha agaghị anabata nwaanyị ọbụla dị ime ka ọ gbaa akwụkwọ n'ụlọụka.,"Nke a so na ngụpụta Bishọp dayọsis ahụ bụ Chukwudi Ezeofor n'ọgbakọ mbụ nke sinọd ise dayọsis ahụ. Bishọp Ezeofor gbadoro ụkwụ n'ụzọ ihe atọ: N'ime mkpebi atọ ndị a, nke na aboli uzu bụ nke mbụ na nke abụọ nke kwuru na ha agaghị agba ndị bikoro nakwa nwaanyị dị ime akwụkwọ. Otu ụkọchụkwụ n'ime dayọsis ahụ bụ Ven Chukwudi Osondu kwuru na mkpebi bụ maka na ọtụtụ ụmụnwoke na-ama Chukwu aka n'ihu site n'ikwu na ha chọrọ ịma ka nwunye ha aga atụli ime tupu ha agbaa akwụkwọ. Osondu kwuru na ụdị ihe a bụ ịma Chukwu aka n'ihu maka na nwaanyị dị ime nwere ike nwa ya apụọ maọbụ nwa ahụ anwụọ agbanyeghi na ha emetọọla akwa alụm di na nwunye ha dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo. Otu ihe ọzọ pụrụiche ọsọndụ kwukwara bụ na agbam akwụkwọ bụ n'etiti mmadụ abụọ bụ di na nwunye mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ dị ime, ị mara na ọ bụ n'etiti mmadụ atọ maọbụ anọ. Agụata abụghị naanị dayọsis ga-eti iwu a N'okwu ya: ""Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ dị ime nwaanyị, ị mara na ọ bụ ụmunwaanyị abụọ na-agba akwụkwọ mana ọ bụrụ na ọ dị ime nwoke, ị mara na ụmụnwoke abụọ na-agba otu nwaanyị akwụkwọ."" Osondu kọwara na ihe a abụghị ihe ziri ezi; ""Anyị ga-akọwara ndị ụka anyị ka ha ghọta, anyị anaghị achụpụ mmadụ n'ụlọụka. ""Anyị ga-enye ndị chọrọ ịgba akwụkwọ akwụkwọ ka ha gaa n'ụlọọgwụ ga mee nyocha gbasara ọtụtụ ihe dịka ọrịa obiri n'aja ọcha nakwa ọrịa ndị gụnyere N'aka nke ọzọ, bishọp Eha-Amufu dayọsis bụ Nkemjika Olinya kwuru na o teela ha bidoro iwu a na dayọsis ha ma ọ na-aga nke ọma. O kwuru na ndị ụka ha nabatara ya nke ọma ma makwara na ha enweghi ike ịgba akwụkwọ ma ha dị ime. BBC Igbo gbara otu nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị aha ya bụ Aloba Oke ajụjụọnụ. O kwuru na ya nabatakwara iwu ndị ụka ahụ maka na ọ bụ ihe ziri ezi. Ndị ọzọ nọkwa n'akara Facebook anyị katọọ atụmatụ nwoke na nwaanyị ibiko ọnụ tupu ha agbaa akwụkwọ. Mana ụfọdụ ndị ntorobịa chere na onweghi ihe o mere ma nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ onwe ha bikọrọ ọnụ tupu ha agbaa akwụkwọ. Chukwuemeka Okereke nọ n'akara Facebook anyị kwuo na ya nabatara ka nwoke nabata enyi ya nwaanyị n'ụlọ ya tupu ha alụọ. Ndị ahụ na-ekwu na onye chọrọ ka ya na nwaanyị ya biri tupu ha alụọ abụghị ajọ ihe maka na ha ka ga-alụ. O kwukwara na ọtụtụ ụmụagboghọ na-eshi ime maka na ha achọghị ka a chọpụta na ha dị ime. Mana otu ihe ndị ụka ahụ kwuru bụ na nwaanyị dị ime nwereike ịga mụọ nwa, oge ọ mụsịrị nwa, ọ bịa a gozie alụm di na nwunye ha, ọbụghịzi agbam akwụkwọ." afirika-45393826,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45393826,Ọdọ ụgbọelu Enugu: Gọvanọ ndị ọwụwa-anyanwụ sị na ọnọdụ ya na-agbawa obi,Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugwu nọ na ya ugbua.,"A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba 2018, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu ka ha bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya. Onye nọ n'isi oche nzukọ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Davịd Umahi, bụkwa aka na-achị Ebonyi steeti, kwuru ihe a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ihe pụtara na nzukọ a ha mere. Umahi sị na ọ dị mkpa ka e mezie ebe a na-anabata ngwaahịa na ya bu ọdọ ụgbọelu. Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu so na ọdọ ụgbọelu nke ụgbọelu si mba ofesi na-ada, mana o nwebeghi ọtụtụ ihe o kwesiri inwe, dịka ọkụ okporo ya, nke ga-eme ka ụgbọelu daa n'abalị. Na bọọjetị nke 2018, a mapụtara nde naịra narị ise maka ọrụ ọdọ ụgbọelu a. Cheta na omeiwu Ike Ekweremadu, bụ osote onyeisi ndịomeiwu ukwu Naịjirịa na ndị omeiwu ọzọ si ọwụwa-anyanwụ, tinyere ọnụ n'ebubo onyeisiala Muhammadu Buhari boro ndị omeiwu na ha chabiri ego e kwesịrị iji rụọ ọrụ n'akwa Naịja nke abụọ, ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu, ụzọ Benin-Ọre nakwa ọtụtụ ọru ndị ọzọ ga-abara ndị Naịjirịa uru ma were ego tinye n'ebe ọzọ. Na nkọwa ya, Ekweremadu kwuru na uche ya na nke ndịomeiwu si ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa dị n'ọdọ ụgbọelu Enugwu so n'ọrụ dị icheiche ndịomeiwu chabiri ego ya. Ekweremadu kwuru na ọ bụ na ngalaba omeiwu a na-akpọ ""committee"" n'asụsụ Bekee ka nchabi a mere, ma kwuo na ndị Kọmiti o metụtara gaha agwa ọha ihe mere na etu o siri mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48806285,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48806285,Igbo culture: Uru iri na abụọ ọmụ baara ndị Igbo,"Igbo sị na a tụọrọ ọmarụ, ọmaru ma a tụọrọ ofeke, o tinye isi n'ọhia.","Ọmụ na Ekpe Igbo bụ ndị Chukwu ji amamihe were gozie. Omeenala Igbo dị omimi ma bụrụkwa ihe Igbo ji anya isi. Otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo bu ""ỌMỤ"". Dịka ndị ihe Igbo na-amasị, BBC Igbo kpọrọ onye ọkachamara n'ihe gbasara omenaala Igbo ma bụrụkwa onyeisi ndị otu Ekpe nke Ogbodiukwu dị n'Ụmụọkpara, Abịa steeti, bụ Ọkaiwu Nzenwa Ibe. Ọ gwara anyị ihe ndị bụ ""njirimara"" ọmụ nakwa ihe ndị Igbo ji ọmụ eme. Ihe e ji ọmụ eme Ọmụ na-egosi ebe mmụọ si apụta 6. Ọmụ e kere n'ukwu osisi na-egosiputa na osisi ahụ dị nsọ n'omenala Igbo. 7. E kee ọmụ n'ụgbọala, ọ na-egosị na ụgbọala ahụ bu ozu. 8. Onye mmadụ bịara nye ọmụ n'aka, dịka ịsị onye ahụ na ya ""kpachara anya"" n'ebe onye ahụ nọ; ya bụ ịdọ aka na ntị. 9. Ndị otu Ọkọnkọ na-eji ọmụ ekewapụta onwe ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị otu ha. Ọmụ n'egosị ihe dị nsọ n'ala Igbo. 10. N'ebe dị ka Ibeku, Ụmụahịa, n'ala Igbo, igbubi ọmụ na-egosi na e mechaala mmemme ahụ dịka ekpe. 11. N'Ọhafịa, ndị na-agba egwu ikpirikpi ọgụ na-akpụrụ ọmụ n'ọnụ. Ha agaghị ewepụ ya tupu agbachaa egwu a. 12. N'agba ọhụrụ a, ndị ụka ji ọmụ eme ụkaọmụ bụ Palm Sunday na Bekee. Ọ bụ ụbọchị ncheta etu Kraist siri banye Jerusalem dịka onye eze. N'ụka ọmụ n'Ụka Holy Ghost n'Ogui, Enugwu, Ụkọchukwu Ambrose Ofordile kwuru na Izu Ụka Dị Asọ a bụ oge onye otu kraist ọbụla kwesịrị iji nyochaa onwe ya rịọ Chukwu mgbaghara maka njọ Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo" afirika-45109772,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109772,Onyeisi ụlọọrụ Inec Mahmood Yakubu akụwaala akụ oyibo nsugbe,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Ihe nkiri na-eme n'ụlọomeiwu sineti ka kpụkwa ọkụ n'ọnụ. End of Twitter post, 1 Akụkọ apụtala na ndị sinetọ mmadụ iri anọ na asatọ debere aha ha n'akwụkwọ na ha akwadoghi ichutu Saraki na Ekweremadu. BBC Igbo amaghị ka akwụkwọ a bụ eziokwu maka na anyị enwetaghị ya n'aka anyị. Ebe ọzọ na Naịjirịa Onyeisi ụlọọrụ Inec Mahmood Yakubu akụwala akụ oyibo nsugbe E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015 O kwuru na ndị ntorobịa hie asaa n'anya jiri ọnụọgụgụ ha tụnyere otu onye vootu na 2019, ị mara na ha ga-ekwu onye ga-emeri. Akụkọ mba ofesi Agbanyeghi na a machiela ude na-eme mmadụ ọcha na mba UK, ndị mmadụ ka na-erekwa ya. Otu ndị ahụ a jidere na mbụ ma taa ha ahụ bụkwa ndị ka na-ere ya bụ ude dị njọ n'ahụ mmadụ na UK N'egwuregwu, Chelsea ga-anọ ọnwa atọ tupu ha ebido ime nke ọma ọzọ. Maurizio Sarri na-anọchi Antonio Conte dịka onye nkuzi ndị Chelsea Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Chelsea nwere bụ Maurizio Sarri ekwuola hoha na o nwereike iru ọnwa atọ tupu Chelsea akpawa ike ọzọ. Sarri kwuru na asọmpi Iko Mbaụwa mere na ya na ndị ọgba bọọlụ ya enwebeghi mmekọ kamgbe. Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Akwa ụzọ Nkwe na Ezere" media-46719980,https://www.bbc.com/igbo/media-46719980,Jair Bolsonaro abanyela ọchịchị dịka onyeisiala mba Brazil,"E duola onyeisiala ọhụrụ mba Brazil bụ Jair Bolsonar, n'iyi ọrụ n'isiobodo ha bụ Brasilia.","Ndị na-akwado Bolsonar bụ onye bụbu onye agha, kwuru na ha na-ele anya ""mgbanwe o kwere na nkwa"" mana ọtụtụ na-atụ egwu na ụdịrị ọchịchị ya nwere ike ibutere ndị Brazil ahụhụ karịa nke ha nọ na ya. US emechiela ụlọọrụ ha dị na Naịjirịa Obi US n'Abuja Mba Amerika emechiela ụlọọrụ ha dị na Naịjirịa bụ nke dị n'Abuja na Legọs ruo mgbe amaghị ama. Dịka ozi ha dere na ọbaozi Facebook, ha kwuru na mmechia sitere na n'ihe na-eme na mba ha. Gọọmentị mba Amerika mechiri emechi kemgbe 22 Disemba 2018 maka na ha ekwọrịtabeghị maka ego Onyeisiala Trump na-ana iji rụọ mgbaaja Mexiko. Dịka BBC Pidgin dere, ụlọọrụ US na Naịjirịa ga-emeghe ma ekpebie okwu gbasara ego ya bụ mgbaaja n'obodo ha. Agbanyeghị na ndị ọrụ ha arụtụghị aka ebe ahụ, mmechie bụ ezigbo ọgbatauhie nye ndị niile akpọrọ oku maka akwụkwọ ikike ha. Ka ọ dị ugbua, ya bụ mmechị emetutela ọtụtụ ihe na mba US dịke ọtụtụ ụlọọrụ mechirila emechị, ndị njem enweghị ike ime njem, ndị ọrụ anataghị ụgwụ ọrụ ha. N'akụkọ ọzọ, Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ Ndị gọvanọ steeti iri na isii dị na Naịjirịa ekwuola na onweghị mgbe ha ji kwu na ha achọghị ịkwụ ego opekatampe ruru puku nari naira atọ kama na ha ga-akwụli puku nari naira iri abụọ na ọma. Ọ bụ Abdulrazaque Bello-Barkindo bụ ọnụ na-ekwuchitere ha kwuru nke a n'ụlọ ọrụ ha ụnyahụ. N'Egwuregwu, Dịka abanyegoro afọ ọhụrụ, ndị mmadụ na-eche kedụ ndị egwuregwu bọọlụ a ga-ere na ndị a ga-azụta. Paul Pogba, Isco na Adrien Rabiot so na ndị ha kpụ n'ọnụ. Akụkọ ga-amasị gị Nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile IIhe nkiri New year eve: Lee ka ụfọdụ ndị Igbo si efere 2018 aka ụla" 42937959,https://www.bbc.com/igbo/42937959,Mmadụ iri abụọ na-aga Yurope anwụọla n'ime mmiri na Morocco,Ụlọọrụ nta akụkọ na mba Spain nke a na-akpọ El Pais kọrọ na ahụrụ ozu seele n'elụ mmiri ihe dika kilomita isii maọbụ asatọ n'ọnụ mmiri obodo Melila.,Akụkọ sị na ndị ọrụ nzọpụta mmadụ na akọwa na ha agụpụtala ozu ndị na mmiri. Melilia na Morocco dịketere nso. Ndị ọrụ nzọpụta nke mba Morocco wepụtara ozu ndị a ka ndị ọrụ otu ụgbọ mmiri na agafe hụrụ ka ha seere n'elụ mmiri we tipụ mkpu kpọọ ha. E chere na ndị a nwụrụ ebe ha na-achọ ị gafenye Yurope n'elu ụgbọ mmiri n'agbanyehị na-enyere ịdọakanantị maka oke ifufe ga-efe. Ndị mbịarambịara Afịrịka na-achọ ịgafe Yuropu siite n'elu mmiri Ndị ọrụ nzọpụta ka nọ n'elu mmiri achọ ozu ndị ọzọ maọbụ ndị ka nwereike ịdị ndụ. Echere na ndị mbịarambịara a si n'ọtụtụ mba nọ n'etiti Afịrịka Ka akụkọ na-apụta amabeghị ezi ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ n'ihe mberede nke a. 43165955,https://www.bbc.com/igbo/43165955,Ndị otu Biafra chọrọ ka Naijiria dị mpaghara isii,Ndị ndu otu na-achọ mnwereonwe Biafra ekwuola ka e dogharia ala Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' na bekee ka ọ dị mpaghara isii nke ga-agbado ụkwụ n'iwu ala anyị nke afọ 1963.,"Ndị otu a kwuru nke a n'ọgbakọ ha nwere na Nnewi, Anambra Steeti nsonso a. Ha jụrụ atụmatụ ihapụ steeti iri atọ na isii e nwere dịka nkewa ọchịchị ala Naijiria, n'ihi na, dịka ha siri kwuo, o megidere ebumnuche ndị Biafra. Ndị soro mee ọgbakọ ahụ pụrụ iche gụnyere otu MASSOB, Biafra United Liberation Council (BULCO),Igbo Hebrew Cultural Restoration na Eastern Peoples Congress (EPC). N'akwụkwọ mgbasa ozi ha wepụtara nke Uchenna Madu (MASSOB), Felix Obioha (EPC) na Amadi Innocent tinyere aka n'aha ndị ọzọ, nke ha nyere ndị ntaakụkọ, ha nwere mkpebi ọtụtụ ihe metụtara mnwereonwe Biafra. Ha kwuru na ha chọpụtara na ndị na-emegide ha n'ụlọ na n'ilo na-enwe ọṅụ mgbe ọbụla ndị otu ha na-eme onye-na-nke-ya, onye-na-nke-ya, ma kpebie na otu ndị na-agba mbọ nwereonwe Biafra ga-ebido mmekọrịta maka mmezu mnwereonwe Biafra. Ha kwuru: ""Ndị otu anyị nọ n'ụlọ ekpebiela na anyị na ndị nọ mba ndị ọzọ ga na-arụkọ maka ebumnuche ime ntuliaka referadum ga-amịta mkpụrụ maka mnwereonwe Biafra n'aka Naijiria."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50470498,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50470498,Constituency Project: Ihe ị kwesiri ịma maka ya,Onyeisiala Muhamadu Buhari nkwuputere okwu tinyere ndị ụlọomeiwu na Naịjirịa n'agbagharịa taa bụ ụbọchị Nọvemba iri abụọ.,"Okporoụzọ ọjọọ O kwuru na o nweghị ihe gbara ọkpụrụkpụ ndị ụlọomeiwu Naịjirịa jirila ego ruru otu tarị n'ụma(1 trillion plus) amapụtara maka ""Constituency Projects"" mepụta kamgbe afọ iri. O kwuru nke a n'ọgbakọ otu 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission'(ICPC) nakwa gọọmenti etiti hibere nso nso a. Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ gịnịdị bụ ""Constituency Projects"" na-ese okwu? Ifeanyi Olumba ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị kọwara na ""Constituency Project"" dịka achịcha a na-ekenye ndị na-anọchite steeti dị iche iche n'ụlọomeiwu ha wegara ndị ha na-anọchite. O kwuru na 'achịcha a' na-abịa n'udi ụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ zuruoke, ụlọ dị ọnụ ana wdgz. Mana o kwuru na ọ na-agba ya anya mmiri ma ọ hụ ka ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu na-enye ndị steeti ha akpa ọsikapa, wil baro, ọgba tum tum, akụrụngwa e ji adụ akwa wdgz. Olumba kwuru na ihe ndị a enweghị isi. Kedụ ka atụmaatụ a si emetụta ụmụ Naịjirịa? Ifeanyi Oluma gara n'ihu kwuo na ọ ga-adị mma ka onyeisiala gbaa n'anwụ ego niile e kenyere ndị ụlọomeiwu na-anọchite ogbe ha site n'afọ 1999 ruo ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara" egwuregwu-47016397,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47016397,Emiliano Sala: Ugboro ole ndị egwuregwu nwụrụ ka ọnwa ha na-achake,"Ọnwụ gburu Emiliano Sala n'ime oge ọ dị ka ọnwa ya achakeela, abụghị mbụ ndị na-akwado egwuregwu na-abanye n'iru uju maka ụdịrị ihe mberede a.","A chọtara ozu Sala n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febrụwarị 2019, n'ime ụgbọelu ọ kpọkasịrị n'ime ya ka o si na mba Frans na-alọghachị Ịngland. Ọ ka binyechara aka n'akụkwọ ga-eme ka ọ malite ịgbara otu Cardiff City bọọlụ. BBC Igbo chọrọ ịkpọpụta ugboro ole ""dara ụda"" ndị egwuregwu bọọlụ nwụrụ ""n'ụtụtụ"" ha. 1) Sam Okwaraji: Okwaraji bụ nwaafọ Igbo nọchitere anya Naịjirịa n'ọgbọegwuregwu ma na-agbara SSV Ulm dị na mba Jamani bọọlụ oge ọ nwụrụ. Ọ nwụrụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọst nke afọ 1989, ka ọ dị naanị afọ 25. Obi koropuru ya ka ọ fọrọ naanị nkeji iri tupu e gbuchie bọolụ n'etiti Naịjirịa na Angola na Legọs. Na nyocha a na-eme ozu tupu e lie ya, a chọpụtara na o nwere ọbara mgbalielu ma hụkwa na obi ya koro eko. 2) Patrick Ekeng: Ekeng bụ onye mba Kamerun so ha gbaa bọọlụ n'Iko Mba Afrịka nke 2015, nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Mee 2016, ka ọ dị naanị afọ 26. Akụkọ kwuru na obi nkoropu gburu ya ka e bugara ya ụlọọgwụ ka ọ dachara n'ọgbọegwurwegwu. Ọ na-agbara ndị otu Dinamo București dị na mba Romenia bọọlụ oge ọ nwụrụ. 3) Cheick Tioté: Tioté bụ onye mba Aịvorị kost a ma ama, nwụrụ ka ọ dị naanị afọ 30. Ọ nwụrụ ụbọchị ise nke ọnwa Juun 2017, ka obi koropuru ya ebe ọ na-eme njike bọọlụ na mba Chaịna. Ọ na-agbara ndị otu Beijing Enterprises bọọlụ oge ọ nwụrụ. 4) Marc-Vivien Foé: Foé bụ onye mba Kamerun, nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun 2003, ka ọ dị naanị afọ 28. Ọ nwụrụ n'ọgbọegwuregwu ka Kamerun na Kolombịa zutere n'asọmpi Fifa Confederations Cup. Ọ dara n'ala n'ime nkeji 76 e ji agba bọọlụ, e nyere ya nleta gbatagbata mana o zughi ịzọ ya ndụ. Makana ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'ọgbọegwuregwu. A chọpụtara na ọrịa obi gburu ya. 5) Davide Astori: Astori bụ onye mba Itali nwụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Maachị 2018, ka ọ dị naanị afọ iri atọ na otu. Ọ nwụrụ n'ụra ka obi koropuru ya, n'ụlọoriri ebe ya na ndị otu egwuregwu ibe ya nọ. Ọ nwụrụ chi foro ụbọchị ndị otu ya bụ Fiorentina na ndị Udinese kwesịrị izute. 6) Olubayo Adefemi: Adefemi nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi Olimpiks nke afọ 2008 nakwa asọmpi Iko Mba Ụwa nke ndị obere a gbara n'afọ 2005. Ọ nwụrụ n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Epreelụ 2011, ka ọ dị naanị afọ 25. Ọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na mba Gris, ka ọ na-akwado ịlọta Naịjirịa maka agbamakwụkwọ ya. Ndị egwuregwu Naịjirịa ọzọ nwụrụ n'ụdịrị ọnọdụ a: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44679204,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44679204,PVC adịgboroja: Alibaba.com na-enyocha ndị na-ere PVC na nke ha,Ndị ụlọọrụ si China a na-akpọ Alibaba.com agwala BBC na ha na-eme nyocha banyere onye na-ere kaadị vootu Naịjirịa a na-akpọ PVC n'aha ịchafụ n'ahịa ha.,"Ha kwuru na akụrụngwa ọhụrụ ha tinyere ka ha chọrọ iji mee ntuliaka na-abịa n'Ekiti steeti Onye kwuchitere ọnụ Alibaba.com bụ Maja Hauke gwara BBC na ha anaghị anabata onye ọbụla na-ere n'ọnụ ahịa ha n'ịntanetị nke dara iwu ha hibere. Hauke kwuru na ha hụrụ na ihe ahụ a kpọsara mefidere iwu ire ahịa ha mere ha jiri wepụ ya ma na ha ga-aga n'ihu ime nyocha banyere aka ọrụ ndị omekome na-ada iwu ha. Cheta na otu na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec bere nwịị na ndị ọjọọ na-eresi ụmụ Naịjirịa ajọ kaadị e ji atụ vootu n'igwe ịntanetị. Onyeisi na-ahụ maka ikuzi gbasara vootu na Inec bụ oluwole Osaze Uzzi kwuru n'elu webụsaịtị ha na ha achọghị iji anya hụ ndị na-akpa agwa ọjọọ a. O kwuru na ha tụkwara anya ụdị ihe a mere ha ji tinye akụrụngwa pụrụiche na kaadị vootu nke ha na-enye ga-eme na nke ndị adigboroja agaghị atụli vootu. Uzzi kwuru na ụmụ akụrụngwa ndị ahụ na-ahụ na kaadị vootu nwere nchekwa tọrọ atọ nke ndị adịgboroja ahụ na-enweghi. Lee ihe ị ga-eji mara kaadị adịgboroja A na-ebinye aka iji nweta kaadị PVC ahụ Agbanyeghi, Uzzi kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ga-eme ọgbakọ gbasara ndịa hụ na-ere kaadị adịgboroja n'ịntanetị ịhụ n'aka kpara ha. Na mgbakwụnye, otu ahụ na-elekwa anya iwejulite igwe e ji atụ vootu a na-akpọ ""Card Reader"" na Bekee iji chekwaa ha megide kaadị ndị na-abụghị ezi ya. O kwuru na ha na-etinyekwu akụrụngwa ndị ọzọ n'igwe ahụ iji chekwaa ya site n'aka ndị adịgboroja ebe ha ga-ebido n'izu a iwejulite igwe ahụ na Naịjirịa niile. BBC Igbo gbara onye na-ahụ maka nkuzi maka ntuliaka n'ụlọọrụ Inec na mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Ijeoma Igbokwe. Nwaanyị Igbokwe kwuru na ndị uweojii nwere ike ibido nwụchiwe onye ọbụla ha hụrụ ji kaadị PVC adịgboroja. Nwaanyị na-ahụ maka nkuzi itu vootu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Ndị na-ere PVC a Webusaịtị na-ere PVC adịgboroja a bụ Alibaba bụ webụsaịtị na-ere ọtụtụ ihe dị icheiche. Otu ihe na-atụ n'anya bụ na webụsaịtị a si mba China ebe a na-emepụtakwa igwe 'Card Reader' Naịjirịa nakwa PVC ahụ na mba China, ọtụtụ a na-ajụ ma China a ga-awakpo ntuliaka Naịjirịa n'afọ 2019. Mana nwaanyị Igbokwe kwuru na ndị ụlọọrụ ha na ndị uweojii na-eme nyocha agbanyeghi na ha ahụbeghi ihe ọbụla na-atụ aka n'ụdị ihe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43468987,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43468987,Idris ekwuola sị kpọghachite ndị uweojii na-eche ndị nkịtị,"Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka akpọghachị ndị uweojii niile na-eche ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị ọcha nọ na Naịjirịa nche.","Ibrahim Idris bidoro ịchị ndị uweojii Naịjirịa n'afọ 2016 Idris kwuru na ọ ga-edegara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akwụkwọ iji nweta nkwado ya, nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ. O kwuru nke a na nzukọ ya na ndị Kọmishọna ndị uweojii na ndị uweojii ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere, nwere n'isi ụlọọrụ ha n'Abuja ụnyaahụ. Idris kwuru na iji hụ na ndị mmadụ mere ihe o kwuru, na etinyela ihe bekee kpọrọ task force nke Adamu Dankwara bụ osote kọmishọna ndị uweojii bụ onyeisi ya. O kwukwara na o nyere iwu ka ndị uweojii bido ime ihe a n'etufughị oge ọbụla. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Idris kwuru sị ""Maka nsogbu anyị na-enwe na Naịjirịa gbasara nchekwa, ọ dịla ezigbo mkpa ka ndị uweojii Naịjirịa wetuo aka n'etu ha si ezipu ndị otu ha n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị nnukwu mmadụ. ""Maka nke a, m ga-edegara onyeisiala akwụkwọ iji nweta nkwado ya nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ nọ n'ime mba a. Etu ahụ, enyela m iwu ka akpọghachite ndị uweojii niile ezipuru ka ha na-echekwa ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-arụ n'ụlọọrụ ọha.""" egwuregwu-47491387,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47491387,Rennes vs Arsenal: E jirila Arsenal chụọ aja ndị mmụọ,Rennes gosiri Arsenal nkarị na Roazhon Park taa ka ha tichara ha egwu fọọ ha aja n'ọnụ.,"Goolu atọ Benjamin Bourigeaud, Nacho Monreal na Ismaila Sarr nyere na ya bụ egwuregwu zuru ime ka ndị Arsenal chee echiche ndụ ha n'abalị a. Na nwaafọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi, nyere goolu n'ime nkeji anọ e ji malite ịgba bọolụ, ezughi inye ha mmeri onye ọbụla nọ na-atụ anya ya. N'ime nkeji 41, onye Arsenal, Sokratis Papastathopoulos, metara ihe e ji chụpụ ya ka ọ natara akwụkwọ edo edo abụọ. Nke a mere ka ndị Arsenal fọ naanị iri n'ime ọgbọ egwuregwu; mere ka ""ọgwụgwọ nsọ"" ha biri ọkụ. Rennes ga-ezute ha na be ha n'Emirates n'izu ọzọ na-abịa, n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị. Akụkọ ga-amasị:" afirika-43912784,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43912784,Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwụọ iti aka n'obi,Akụkọ kachasị n'abalị a Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwọ iti aka n'obi,"Gọọmentị etiti akwụọla ụgwọ ruru nde naira otu narị iri atọ na ise dịka ụgwọ ịti aka n'obi Ọ bụ ezinụlọ mmadụ asatọ ahụ egburu na Apo n'ime obodo Abuja n'afọ 2013 ka ha kwụrụ ụgwọ a. Omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala Mohammadụ Buhari Ndị omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala bụ Mohammadụ Buhari ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ mmadụ ha na-ekwu na ndi ochịehi gburu na Benue steeti. Chete na ụnyahụ ndị ome iwu nta kpọrọ onyeisi ala maka ị za ajụjụ gbasara ogbugbu mmadụ na steetị a. Mana Buhari ekwubeghị oge ọ ga-abịa za ajụjụ a. Mmadụ marị iri anọ apụọla na APGA na APC N'Abia steeti, mmadụ ruru otu narị na iri anọ esiila partyi APGA na APC gawa PDP. Ha kwuru na ha pụrụ makana mpu na aghughọ akariala n'otu ndọrọndọrọ ochịchị ahụ. Anthony Joshuanaghị anabata aka mgba Deontay Wilder ugbua Anthony Joshua ekwuola na ya anaghị anabata aka mgba Deontay Wilder maọbụrụ na ya hụbeghị ego ahụ ruru nde dolla iri ise. Cheta na Deontay Wilder wepụtara ego a iji maa Joshua aka ọkpọ. Na bọọlụ Arsenal na Atletico Madrid ga-asọ mpi n'iko Europa League Marseille na FC Red Bull ga-asọ kwa mpi n'iko asọmpị iko a Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị mere taa.." mba-uba-43460321,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43460321,A nwụchiela Bishọp ụka Katọlik maka imefu ego ụka,Ndị uweojii nwụchiri Bishọp Jose Ribeiro bụ Bishop ụka Katọlik nke obodo Formosa dị na Brazil maka mmerụaka.,"Aka ndị uweojii akparala A na-ebo Ribeiro na ụkọchukwu isii ndị ọzọ ebubo na ha mefuru dola puku nari isi nke a na-kọtara na obodo atọ dị nsọ n'isi obodo Braasilia. Dịka ndị nyocha sirikwuo, ego ndị bụ ego a nakọtara na oge onyinye, agbamakwụkwọ n'ime mmirichukwu. Ndị uweojii na-ekwu na ha naele anya inwuchị ndị ọzọ ebubo metụtara. N'aka nke ọzọ, n'ala Naijiria, Achịbishọp ụka Katọlik na Owere bụ Anthony Obinna etiela mkpu na ndị otu gọọmenti na-achị Imo Steeti na-eyi ya egwu imemila ya. O kwuru na nke a bụ n'ihi na o kwugidere mbọ Govanọ Rochas Okorocha na-agba ịhụ na ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu banyere ọkwa Gọvanọ n'afọ 2019. Achịbishọp kwuru nke a n'akwụkwụ ntaakụkụkọ nke ụka Katọlik na-ebibuta n'Imo a kpọrọ 'Leadership.' Ọ gara n'ihu kwue n'ụka agaghị agba nkịtị ihe a na-emebi dị ka o si dị n'Imo Steeti ugbua. N'izu ole na ole gara aga, n'akwamozu ebe achbishọp na kwuo na Govanọ Okorocha enweghị ikiike ikwu onye ga-anọchhị ọkwa Govanọ na ọ pụọ n'ọchịchị, na ọ bụ ndị ndị mmadụ ga-ekwu, nke mere ka ndị otu Ugwumba bụ otu na-akwado maka ịbanye n'ọkwa ọchịchị nke Uche Nwosu bidoro ịma achibishọp aka n'ihu. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na onye ndụmọdụ nke Gọvanọ n'ihe gbasara ntuliaka bụ Steve Asinobi,kporo ndị ntaakụkọ ebe ọ nọ kwue na ha agaghị eji nwayọọ so Achibishọp Obinna' dịka Ikedị Ohakim siri mee n'poge ọchịchị ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43089487,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43089487,Onye Naịjirịa ekperela azụ n'ọsọ skeleton na South Korea,Nwaafọ Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo ekperela azụ n'ọsọ nkwado skeleton nke wịnta olimpiks a na-eme na South Korea.,"Simidele Adeagbo gụrụ maka ntaakụkọ na mahadum Adeagbo kpetere azụ n'ọsọ nkwado abụọ agbara n'asọmpi skeleton ụbọchị Fraide. O ji ihe karịrị ntabianya abụọ na ọkara ghara ịgbada ugwu n'elu efere igwe karịa onye gbakarịchara ọsọ na nkwado ahụ bụ Lizzy Yarnold, onye Britain. Yarnold gbazuru nke ya n'ime ntabianya 51.66. Mana Adeagbo - onye Naịjirịa nke mbụ n' asọmpi na wịnta olimpiks - anaghị ekwe ya kpasuo ya iwe. Simidele Adeagbo malitere ịgba ọsọ skeleton n'ime ọnwa anọ gara aga Nick Hope bụ onye BBC dere n'igwe okwu Twitter: Hope kwukwara na onwetere nkwado si n'ụlọ nke si n'aka ndị Naịjirịa ibe ya so asọmpi." afirika-43106466,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43106466,Uweojii: Kwụsinụ i nata ndị ụnụ amaghị enyemaka,Ụlọọrụ uweoji dị na Enugu anwụchiela onye mara maka izu ohi na ATM na Enugu ma na gburugburu ya.,"Ka mgbe ATM batara na Naijiria, ọdịzịrị ụmụ mmadụ fecha fecha ị dọrọ ego n'ụlọakụ Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugu steeti bụ Ebere Amaraizu kwetere taa na-anwụchịrị ya bụ omekome n'ụbọchị Febrụwarị iri asaa na-ebe elekere iri na otu na atọ. Amaraizu kwuru na-enwudere ya bụ onye a na-enyoenyo na ATM dị na Rangers Avenue n'Enugu ebe o ji kadị isi eji a dọrọ ego bụ nke ndị mmadụ. O kwuru na onye a ana-enyoenyo nyere aha ka Augustine Nwoko bi na 34 Carta Street,ogui, Enugu gwara ha na o na-eji aghụghọ awakpo ndị arụrụana ya metụtara. Nwoko na-enyere ndị uweojii aka ichọpụta ndị ya na ya so eme mkpamkpa a. ""Ha na-eji na ha chọrọ inyere ndị mmadụ aka dọrọ ego na ATM nara ha akara ha ,zuo ha oshi. ""Tupu imara ihe na-eme nụ ha kpiri akara njiri mara onye,nyeghachi gị kadị ATM yiri nke onye ahụ"". ""Ha ejiri zie nwayọ dọkọrọ ego niile dị na akaunt onye ahụ"" Amaraizu were ohere a wee kọwapụtara BBC Igbo ụzọ ole ma ole mmadụ nwere ike ị gbanahụ ndị ohị ATM: Mgbe agbara Nwoko ajụjụ ọnụ,okwu kwara na osonyere otu na-anọ akụkụ ATM,ghọria ndị mmadụ ka ha che na ha na-enyere ha aka i dọrọ ego. Amaraizu dụrụ ndị mmadụ ọdụ ha kpachapụ anya maka emume ndị omekome ndị na-abiakụte mmadụ ka agasi na ha chọrọ i nyere ha aka." afirika-51450720,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450720,Love Relationships: Lee ihe anọ ga-eme ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị,Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ebe nwoke na-agba n'ezi na-ekodo aka n'ihe dị icheiche ikwu na ọ bụ ihe mere o ji eme ihe ọ na-eme.,"Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ego Ọtụtụ n'ime ndị na-akpa agwa a anaghị eche maka ọnọdụ nwunye ha lụbatara n'ime ụlọ nọ n'ime ya ka ha na-eme etu a n'ihi na ọ bụ nke masịrị ha ka ha chọrọ. Mana ụfọdụ ndị na-akpa agwa a amaghị na e nwere uru dị n'ịchịba ụkwụ n'ụlọ, biri n'udo dịka di na nwunye, na-agbaghị n'ezi. Ị na-ajụ 'kedụ uru nwanụ'? Ngwa lee ha ebe a: 1) Ọ ga-akpịtara gị ego: Ị tinye anya gị naanị na nwaanyị ị lụrụ alụ nke gị na ya bi n'ụlọ, ị gaghị na-atufu oke ego. Onye ọbụla ma na ịchụ nwaanyị na-ebute ntufu ego; nke bụ na ị ga na-enye nwaanyị ahụ ị na-achụ ihe niile ọ chọrọ n'ihi na ị chọrọ ime ya obi ụtọ. Ọtụtụ nwaanyị a lụrụ alụ na-abụkarị odoziakụ karịa ndị nke a na-akpọ 'side chick' na-abụkarị akụ ka ha bịara iri Marakwa na ụfọdụ 'na-azụ' enyi ha nwaanyị ma na-elekọtakwa nwunye ha na ezinaụlọ ha. Mana nwanne ọ bụrụ naanị n'ahụ nwunye gị ka anya gị dị, ị mara na ị gaghị eke ego na akụnaụba gị ụzọ abụọ. Makana odoziakụ gị ga-eji ego ahụ mepụta ihe ị hụrụ anya, n'ụzọ ga-amasịkwa gị. 2) Ọ ga-akwudo gị n'akụkụ ma n'ụbịam ma n'akụnaụba Gị na-agụ akụkọ a kwuo eziokwu, ugboro ole ka ị hụrụla maọbụ nụ akụkọ nwoke na-agba n'ezi enyi ya nwaanyị wụsara ya n'ala n'ihi na ọ naghị enyezi ya ihe ọ chọrọ? N'ihi na ọtụtụ oge ego ka ụmụnwoke na-eji achụta nwaanyị na-abụghị nwunye ha, ọ na-abụ ihe ntakịrị dịka ọdachi dapụtara ha, enyi ha nwaanyị ahụ ewee mwemwe ọsọ mgbe ọ hụrụ na ego adịghịzịkwa gị n'aka ọzọ. Mana ọtụtụ oge ka nwunye ha lụrụ na-enwere ha ndidi ma ihe isiike dapụtara ha. Ha na-echeta nkwa ha kwere mgbe a na-ejikọ ha n'ụlọụka ebe ha kwuru na ha ga-ahụ di ha n'anya ""ma n'ụbịam ma n'akụnaụba"". Ọ bụkwa nwaanyị ị lụbatara n'ụlọ ga na-ekpuchi gị ka ihere ghara ime gị ma ụwa gị tụgharịa. 3) Ụjọ ọrịa agaghị na-atụcha gị: Ị na-anụ mgbe ọ na-abụ a na-ejikọ di na nwunye n'ụlọụka ha ekwe nkwa ""ilekọta gị ma n'ọrịa ma n'ahụike""? Ị bụrụ onye na-achụ nwaanyị, mgbe ọrịa dị aṅaa bịara gị ka ị ga-ama ma nke a ọ bụ eziokwu ma ọ bụ asị. Ọtụtụ oge, ụdịrị ọsọ nwaanyị ahụ ị na-achụ ga-eji wụsa ihe niile gbasara gị wee gbafuo, ị ga na-ajụ ""kedụ onye m mejọrọ n'ụwa?"" Ọ bụkwa nwaanyị ahụ ị lụbatara n'ụlọ na-anọkarị, lekọta gị n'ọrịa ahụ ma na-ekpekwa ekpere ka ụdịrị ihe a ghara ịdakwasị gị ọzọ. 4) Ihe ị na-achọ n'uko elu dị n'uko ala: Kwuo eziokwu, kedụ ihe na-eme ka ị chụrụ nwaanyị pụọ n'ezi? Ọ bụ mma? Ezigbo ahụ? Amamihe? Ịhụnanya? Ọ bụrụ na ị na-agwa onwe gị eziokwu ị ga-ama na ọtụtụ oge ihe ahụ ị na-achọ n'ezi nọ n'ime ụlọ gị. Ụfọdụ oge ị naghị ahụ ya n'ihi na ị chọghị ịhụ ịhụnanya nwunye gị bụ nwaanyị mụrụ nwa/ụmụ gị, na-egosi gị. Mana ị ma na ị na-egosikwa nwunye gị ịhụnanya ọ na-egosi gị, na enweghị ihe ị chọrọ ka o mee ọ na-agahị emere gị? Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ka ụmụnwaanyị ndị buru ibu na-agba mbọ ịta ahụ ka ha nwee ike ịdị ka ụdịrị nwaanyị di ha na-achụ n'ezi. Nke a bụ ọmụmaatụ ihe ịhụnanya nwereike ime. Ihe ndị ọzọ dị iche iche kwesịrị ime ka nwoke ghara ịchụ nwaanyị maọbụ gbaa n'ezi. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile" afirika-57130630,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57130630,Chelsea vs Leicester City: Leicester City anapụla Chelsea iko FA ma bunye ha iko anya mmiri akwa,A gbawala m aka bụzi ekpere ndị Chelsea na-ekpe ugbua dịka Leicester ji otu ọkpụ gbajie ha aka ma naara ha iko FA.,"Nke a tụrụ Chelsea na ndị nkwado ha n'anya maka na ebumnobi ha bụ imeri asọmpi a. Leicester nyere goolu ha ji merie na nkeji 63' site n'aka Youri Tielemans. Chelsea gbara mbọ ịsa goolu ahụ mana obi gbawara ha mgbe ogbu pịpịrọ kagburu goolu sị na ọ bụ 'offside'. Nke a mere anya mmiri jiri jupụta otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha n'anya dịka e gbuchiri bọọlụ na nkeji 90'. Ụmụafọ Naịjirịa abụọ na-agbara Leicester bọọlụ bụ Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi gosipụtara obi ụtọ ha na mmeri a. A na-atụbu anya na Chelsea nwereike ịmabute iko abụọ gụnyere FA na Champions League mana mmeri a akachapụla nke ahụ. Ugbua ekpere ndị Chelsea ga-abụzi ""Agbawala m aka iko n'afọ a"" dịka ha ga-ezute Manchester City n'asọmpi ikpeazụ nke Champions League." afirika-52281145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52281145,Coronavirus Lockdown: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmechi obodo n'ihi coronavirus,"Awa ole na ole agaala kemgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputere ndọtị iwu onye nọrọ n'ụlọ maka mgbochi mfesa ọrịa Coronavirus na Legọs, Ogun steeti na Abuja.","Mana ndị mmadụ ka kpụ ya n'ọnụ n'ihi na okwu mmachibido a metụtara ma onye ukwu ma onye nta. N'ụbọchị 31 nke Ọnwa Maachị 2020 ka Buhari kwuru ka e mechie steeti atọ a, mana ọ dọtikwuru ya izu abụọ ọzọ n'ihi na ọrịa a ka na-enye nsogbu na Naijiria. Gịnị ka ndị mmadụ na-ekwu maka ya 1) AGỤỤ: Agụụ so n'otu ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka ha na-atụgharị uche maka okwu onyeisiala Buhari. Ebe ụfọdụ na-ekwu na ihe ha goro iji chekwaa onwe ha n'izu abụọ gara aga agbadaala/agwụla, ndị ọzọ na-ekwu na agụụ dị n'obodo ga-egbu ndị mmadụ tupu ọrịa a akpata ha aka. Ọtụtụ kwuru etu ihe nri na enyemaka gọọmenti kwuburu na ha ga-eke ndị mmadụ, erughị ha aka nke ha ji ahụ ya anya, ebe ndị ọzọ kwuru na ihe gọọmenti kere enweghị ka ọ ha aha. Ndị mmadụ ejirila makana Buhari kwuru na ọ ga-eke ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ego iji nyere ha aka n'oge a, tiwe mkpu na soshal midia si gbatara ha ọsọ enyemaka nke ha. Ha kwuru na izu abụọ a gọọmenti tụkwasịrị ga-ata akpụ ka alanga, nke bụ na ha chọrọ enyemaka chọsie ya ike. 2) NCHEKWA: Kemgbe izu a, ụfọdụ ndị bi na mpaghara Legọs gụnyere Ọgba, Egbeda, Agege na ebe ndị ọzọ chị obi n'aka ka ha na-emechi naanị otu anya alaba ụra. Gịnị kpatara ya? Ndị omekome na-enye oke nsogbu kwa abalị, nke kawanyere njọ ugbua mmadụ niile nọ n'ụlọ. Ndị mmadụ akpọkuola gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi mwakpo a ndị ohi na-awakpo ha. Ha na-atụ ụjọ na ndọtị a a dọtikwuru oge ịnọ n'ụlọ ga-eme ka ndị ahụghị rie chụrụ ndị ha chere na ha nwere ma nwebiga ya oke, gawa. Ọkachasị ụfọdụ ndị sị na ndị ohi ahụ na-edetara ha akwụkwọ ozi iyi ha egwu maka ọbịbịa ha. 3) ỌRỤ: Ụlọahịa niile kpọchiri akpọchi Ọtụtụ bụ ndị oji ego achụ ego ekwuola na ndọtị mmachibido anaghị enyere ha aka n'azụmahịa ha. Ha kwuru na ọ na-abụ site n'ihe ha zụpụtara maọbụ rụpụta ka ha zi azụ onwe ha nakwa ndị ọzọ gụnyere ndị na-arụrụ ha ọrụ, nri. Iwe ha bụ na ndọtị a ga-eme ka ha ghara ịkpata ego iji nyere onwe ha na ndị ahụ aka. 4) IKE ỌGWỤGWỤ: Dịka gọọmenti na-ekwu na ọ dị mkpa ịnọ n'ụlọ maka ibelata mfesa ọrịa a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ike agwụla ha. Ha na-ekwu na ""ọkụ adịghị, nri adịghị, ego adịghị"" na ha amaghị etu ha ga-esi nọrọkwa izu abụọ ọzọ n'ime ọnọdụ a. Ebee ka gọọmenti kwụ akwụ? Gọọmenti na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus a ga-akwụsị ịrị n'ime izu abụọ a, nke bụ na ọ ga-anọzị n'ụzọ ụla. Ọ bụrụ na nke a mee, obodo ndị a nwereike laghachi na ndụ ha na etu ihe dịbu." afirika-49883577,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49883577,Nigeria Independence day : Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okpụrụkpụ ndị a Buhari kwuru,Onyeisiala Muhammadụ kwuru na ụbochị mbụ nke Oktoba nke afọ ọbụla na-abụkarị mgbe eji eṅomi ma kele Chukwu maka ihe ndị o merela Naịjirịa.,"Anyị ga-achịkọtara ụnụ ihe niile o kwuru n'ụzọ asatọ a. Nchekwa Onyeisiala Buhari kwuru kelere ndị agha na ndị uweojii etu ha si agba mbọ ịhụ na Naịjirịa nwere ezigbo nchekwa. O kwuru na ọchịchị na-agbasị mbọ ike ihụ na ha gboro nsogwu ndị Niger Delta na-enwe ma hịcha Ogoni bụkwa nosgbu gburugburu ebe ahụ nwerela kamgbe. O kwuru na mpụ eji kọmpụta arụ na-arị ibe ya elu mana ha ga-agba mbọ hụ na ya bụ agwa ọjọọ biara na njedebe. Akụ na ụba Naịjịrịa Buhari kwuru na ọ ga-agba mbọ hụ na akụ na ụba Naịjirịa kwụsie ike ma bụrụ nke onye ọbụla ga-enwe ohere isonye mee ka o wulite nkeọma. Anyị ga na-agba mbọ ihụ na anyị chọtara ụzọ ndị ọzọ anyị ga-eji wulite akụ na ụba Naịjirịa ma na-emekwa ka ego anyị na-enwete na mmanụ agbịdị na-aba nnukwu uru. 2nd Niger Bridge Anyị ga-arụcha akwa mmiri a n'afọ 2022. Cheta na akwụsịrị ọrụ ebe ahụ nso nso a. Ntụbata nri Anyị agaghị alaghachị n'itụbata nri na Naịjirịa ma na-ebupu ọrụ anyị nye ndị ofesi. Otu Economic Advisory Council Buhari kwuru na okpokobara otu a ka ha wee mee ka ihe ụfụ nwereike ịpụta n'ụfọdụ mkpebi ha mere maka akụ na ụba Naịjirịa ghara inye ụmụ Naịjirịa nnukwu nsogbu. ""Anyị ga-agba mbọ tinyekwuo ego n'agụmaakwụkwọ, ahụike, mmiri na idiọcha na ịhụ na nri gbara kasaa."" Ibuso mpụ agha Mpụ na nrụrụaka na-abawanye ụba n'obodo mana ""a na m arịọ ka steeti niile nọ na Naịjirịa hụ na mere ndị si ebe kwụba aka ha ọtọ n'ebe ego dị. Buhari kwuru na ""Ministry of Justice"", otu dịka ""Independent Corrupt Practices Commission"", Economic and Financial Crimes Commission, ga-aga n'ihu na-ebuso mpụ agha. Ọ rịọkwara ụmụ Naịjirịa ka ha kpesa ma ma aka gbasara omume mpụ ọbụla ha hụrụ n'akụkụ ha ka obodo kwụsị ịbụ nke eji mpụ na nrụrụaka wee mara. Na Nchịkọta, Buhari kwuru na na-agbanyeghị nsogwu niile Naịjirịa nwere ugbua, ọ ga-akwụsị ike karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na anyị niile jịkọ aka mee ka ezigbo ọchịchị na nwulite akụ na ụba tọọ atọ n'obodo. Ọ na-rịọ ka ụmụ Naịjirịa chekwa obodo ha n'aka ndị na-achọghị ọganihu ha. Nnamdi Azikiwe, Ahmadu Bello na Abubakar Tafawa Balewa Ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba dị ezigbo mkpa nye ndị Naịjirịa, ọ bụ ụbọchị Naịjirịa nwere onwe ya site n'aka ọchịchị ndị Briten. Taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2019, Naịjirịa na-echeta ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ iri ise na itoolu (59yrs). Lee ụfọdụ ihe ndị dị mkpa banyere ụbọchị nnwere onwe Naịjirịa: Etu aha 'Naịjirịa' si pụta Onye chepụtara aha a 'Naịjirịa' bụ Flora Shaw nwunye Lord Lugard. Lord Lugard bụ onye agha mba Briten kpokọtara mpaghara niile mejupụtara Naịjirịa ma bụrụ gọvanọ-ọchịchị mbụ nke Naịjirịa. Flora wetara echiche site n'osimmiri Naịja nke mere kpọọ ya mpaghara 'Naịjirịa'. Ndị nna nna hiwere Naịjirịa Nnamdi Azikiwe, Ahmadu Bello na Abubakar Tafawa Balewa 'A sị na onye a na-akpọ nwere nke ọ na-eme', ya mere ndị a bụ ndị gbara ezigbo mbọ ịhụ na Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960. Ndị a gụnyere; Nnamdi Azikiwe - E ji 'Zik' mara ya, ọ bụ onyeisiala mbụ nke Naịjirịa mgbe ha nwechara onwe ha. Obafemi Awolowo - O hiwere atụmatụ agụmaakwụkwọ n'efu na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa na otu a kpọrọ 'Action Group'. Ahmadu Bello - Ọ bụ ya hiwere otu 'Northern People's Party (NPP) n'afọ 1951 mana ya na Nnamdi Azikiwe mechara hiwe NCNC iji zọta nnwereonwe n'aka ndị Briten. Abubakar Tafawa Balewa - Ọ bụ ya bụ Praịm Mịnịsta mgbe Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960 nakwa 1964. Etu ndị Naịjirịa ji echeta nnwere onwe ha Ụmụafọ Naịjirịa niile na-ele anya maka ụbọchị ncheta nwereonwe ha n'aka ndị ọcha 'Briten'. Site na mgbasa ozi onyeisiala na TV nakwa Radio rue n'ọtụtụ egwu ọdịnala ụmụakwụkwọ na-agba, tinyere ụbọchị ezumike a tụkwasịrị n'elu ya. Nke a na-enye ndị mmadụ ohere ịtụgharị uche n'ihe niile Naịjirịa riterela kamgbe nnwereonwe ya. Akụkọ ndị ọzọ dị mkpa banyere Naịjirịa Akụkọ ndị ga-amasị gị Ị ga-ejinwu asụsụ Igbo gụọ abụ ala Naịjirịa?" afirika-46015561,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46015561,Nnamdi Kanu: Etu m si gbalahụ ndị agha Naịjirịa,"Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Ipob gbagara Izrel oge ndịagha wakporo ya, kwuru na ndị nọ ya n'akụkụ zopuru ya.","N'ime ihe onyonyo ndị Kani Pbc (Israeli Public Broadcasting Corporation) ebe a gbara Kanu ajụjụ ọnụ, ọ kọwara etu o si gbalahụ ndị agha Naịjirịa oge ha bịara ime Egwu Eke n'ụlọ nna ya n'Afaraukwu, Abịa steeti. Kanu kwuru na ụfọdụ ndị na-akwado ya zopuru ya tupu ndịagha Naịjirịa abịarute n'ọnụụlọ ya, ma zopukwa ya na Naịjirịa ebe o si gaa mba Izrel ka o nwetachara onwe ya. O kwuru na ọ gara Izrel maka na ọ ma na ọ bụ naanị ebe ahụ ka ọ ga-anọnwu na-enweghị mmekpahụ ọbụla, na ọ gaghị Briten maka na obi erubeghi ya ala ịga ebe ahụ. Cheta na ndị agha Naịjirịa bịara gbaa Egwu Eke ahụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 2017. Ihe ise Nnamdi Kanu chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa A gụpụ mwereonwe Biafra n'akụkụ, Kanu kpọpụtara ihe ole na ole o kwuru sị na ọ gwara gọọmentị Naịjirịa ka o mee. O kwuru na o degaara gọọmentị akwụkwọ ozi iji gwa ha mezuo ebumnobi ya. Akukọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43927487,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43927487,"Ndị na-agụ BBC Igbo kwuru na ""Buhari adịghị ike ọrụ""","""Anyị chọrọ ka Buhari pụọ n'ọchichị"" ka ndị mmadụ na-ekwu maka onyeisiala Muhammadu Buhari.","Ndị omeiwu sineti na ndị bishọp ụka Katọlik akpọọla ka e wepụ Buhari N'agbanyeghị na Buhari achịala Naịjirịa ugboro abụọ; dịka onyeisi ndị agha Naịjirịa site n'afọ 1983 ruo afọ 1985 nakwa dịka onye nkịtị site n'afọ 2015 ruo ugbua, o kwuru na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019. BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ihe kpatara ha ji chọọ ka Buhari hapụ ịzọ ọchịchị onyeisiala ọzọ. Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ha achọghị ka ọ chịa ọzọ maka na ""ọ maghị ihe ọ na-eme"". Ihe BBC Igbo jụrụ ha Content is not available End of Facebook post, 1 Ihe ha zara Ha kwuru uche ha ebe a: Arụmụka ahụ pụtara maka na ndị omeiwu sineti kwuru na ha chọrọ iwepu onyeisiala Muhammadu Buhari maka na ọ nataghị aka elu iji wepụ ego na ụlọakụ nke mmanụ. Buhari wepụrụ ego ruru nde dọla narị anọ iji zụọ ụgbọelụ mana nke a adịghị ndị ommeiwu mma n'obi. N'aka nke ọzọ, ndị bishọp ụka Katọlik akpọkwala oku ka Buhari rituo maka mkpa mkpa ndị ochịehi na-akpa na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43959658,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959658,Ụka Metọdist: Kpọọ ndị ọchịehi 'ndị oyiegwu',Ụka Metọdist na Naịjirịa akpọkuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka o kwupụta ndị ọchịehi dịka otu na-eyi ndụ egwu n'ihi ogbugbu ndị mmadụ ha na-egbu na Naịjirịa.,"Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa N'ime ozi onyeisi( Prelate) ụlọụka ahụ bụ Eminensị Samuel Kanu Uche na odeeakwụkwọ ọgbakọ ha bụ Rev. Michael Akinwale wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ndị isi ụlọụka ha mere na Yaba, Legọs Steeti. Samuel Kanu kwuru na echiche na agwa ndị ọchịehi mere ka ha dịka ndị Boko Haram bụ ndị a kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu kemgbe 2013. Onyeisi ụka ahụ katọrọ ọchịchị Buhari maka ịkpọ otu Ipob ndị na-eyi egwu ma gbaa nkịtị n'okwu gbasara ndị ọchịehi. Ọ katọkwara ogbugbu ndị ụka kraịst na ndị ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ na Benue Steeti ma kpọkuo ọchịchị Buhari ka o cheekwa ndụ ndị Naịjirịa agbanyeghị okpukperechi ha. O kelere gọọmentị na mkpebi ha igbochi ịchịgharị ehi ma hiwe ọdọ ebe a na-azụ ehi iji kwụsị ogbugbu ndị mmadụ. "" E kwesiri ime ihe niile iji kwado ịdịnotu n'etiti ndị Naịjiria agbanyeghị okpukpere chi ọbụla. O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa ala Naịjirịa anaghị arụkọ ọrụ ọnụ bụ nke mere e ji tọọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi na Yobe Steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50135780,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50135780,'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK,Onye bụbu minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani Kayode akwọọla aka Pontus Pirate n'isi aha ndị Yoruba.,"Nwaamdị ahụ eji FFK mara sị na ọ bụ ndị Fulani nyere ha aha ahụ, nke ha kpọrọ Yariba n'olu ha. Ọ sị na ndị Fulani ji ya bụ aha eme ndị agbụrụ ya akaje maka na ya bụ yariba pụtara "" muchi muchi na Onye ihu abụọ"". FFK sị na ""agbụrụ m abụghị ndị muchi muchi maọbụ ndị ihu abụọ"". FFK sịkwa na ọ bụ otu aka ahụ ka ha sị akpọ ndị Igbo Yamiri. End of Twitter post, 1 Ebe ndị Igbo jụru nke ha, ndị Yoruba nabata nke ha. Ọ sị na agbụru ya bụ ""Karo Jire"" maọbụ ""Oduduwa"", ebe asụsụ ya bụ Anago. FFK sị onye anwakwala anwa kpọọ ya onye Yoruba ma kpọkụọ ndị agbụrụ ya niile ka ha jụ aha ahụ kpam kpam. Ọ sị na onye ọbụla na-aza aha ahụ site ugbua ""amaghị ihe ọ na-eme onwe ya na ndị agbụrụ ya niile"". N'otu aka ahụ FFK kọtọkwara aha Naịjirịa n'akara twitter ya bụ nke ọ sị na ọ bụ ndị Bekee nyere ha aha ahụ nke ọ sị na ọ pụtara ""obodo ọchịchịrị"". Ọ sị na aha ndị ahụ bụ mkparị nye ndị agbụrụ ha ma sị onye ọbụla azazịla ya. AKụkọ ga-amasị gị 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-44559531,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44559531,Etu Gwomgworo si dagbuo ihe karịrị mmadụ atọ n' Ojuelegba,Ebe niile dara jụụ n'abali abụọ gara aga n'Ojuelegba nke dị na Legọs steeti ebe gwongworo bu osisi si n'elu akwa daa n'elu ụgbọala atọ.,"Ihe mere eji kpụrụ Ojuelegba n'ọnụ. Foto dị ịcheiche na-agagharị na soshal midia na-egosi ebe osisi kwọrịrị ụgbọala ndị so na ihe mberede a. Ndị ọrụ gbata gbata na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede a bụ atọ mana ndị hụrụ mgbe ihe a mere nọ na-ekwu na ọnụọgụgụ ahụ ga karị atọ. Eburu kwara ụfọdụ ndị mmadụ gaba ụlọọgwụ ị nata ọgwụgwọ ebe amabeghị ọnọdụ ndụ n'ọnwụ nke ha so na ya. Ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorobia na-egosi iwe ha maka ihe mberede a, na-ekwu na ọ bụ ihe enwereike ịgbochi ma ọ bụrụ na gọọmentị na-arụ ọrụ ka ha si kwesi. Ha kwuru na ebe ihe yiri nke a mebụrụ mbụ na gọọmentị ekwesila ị me ihe ị hụ na ihe a agaghị eme ọzọ. @KingNomso kwuru na ugbua abụghị mbụ ihe a na-eme @cchukwudebelu sị na ọ bụ anya erụghị ala gọọmentị butere nke a @MrNosegbe kwuru na ebe ihe ruru otu ụbọchị gachara ndị gọọmentị ka gbachị nkịtị @AustinYugo dọrọ aka na-achị Legos steeti bụ Akinwunmi Ambode aka na ntị maka nkịtị ọ dịka ọ gbachiri gbasara owku a" afirika-51233283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51233283,Nnamdi Kanu: Yoroba agakwala n'ụlọomeiwu steeti ime iwu maka Amotekun,Onye ndu otu Ipob Nnamdi Kanu adọọla ndị ọdịda-anyanwụ aka na ntị sị ha ha chọọ ka okwu Amotekun nwee isi ha agakwala ụlọomeiwu steeti ha ime iwu maka Amotekun.,"N'ozi ọ gbasara n'abali Fraide, na soshal midia, o kwuru na a ga-eji ndọrọndọrọchị na ego mesaa ndị ụlọomeiwu ha anya ma ekposa ya bụ otu nche. Kanu , onye tụrụ arịrị n'ogbugbu mmadụ ka na-arị elu na Naijria, toro ndị gọvanọ ndị steeti nọ na Ọdịda anyanwụ maka ịtụpụta atụmatụ Amotekun. maka ichekwa mpaghara ha. Ọ gara n'ihu kwaa ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ emo maka ị nọ ịnọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ. Ọ gara n'ihu "" Ihe ndị Ugwu ji ka anyị mma bụ na eche anyị ego n'ihi anyị ara ụmụ nne anyị ree agbụụ anyị."" Brexit: Anyị ga-apụ n'Jenụwarị- Boris Johnson Boris Johnson ebinyela aka na Mba Briten ga-apụ na EU n'aabalị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ a. Naijiria na mba Macao ga-agbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka na nkwekọrịta ka Naijiria na Obodo Macao dị n'okpuru China ịgbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ. na mba abụọ ahụ. Ozi sị akara Twitter ụlọọrụ onyeisiala kwuru na nke a na-eso nkwubi okwu nke imeobi gọọmenti etiti nwere maka ya bụ okwu n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst afọ 2018. Ha nọrọ ebe ahụ nọrọ nye ọkaikpe ukwu Naijiria ntụzịaka ka ọ kwado akwụkwọ nkwekọrịta ahụ. Kingsley Moghalu edegarala Ụlọomeiwu Ukwu akwụkwọ mkpesa Kingsley Moghalu bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ Kingsley Moghalu bụ nwa afọ zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu YPP edegarala ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akwụkwọ mkpesa were kpọọ oku ha haziharịa iwu ntuliaka. Moghalu chọrọ ka e me ya iwu iji teknụzụ eme ntuuliaka dịka ịdeba aha,inyocha aha nakwa ikpokọta mpụtara vootu a tụkọtara na ntuliaka. Ọchọrọ ka iwu Naijiria nabata 'smart card reader.' O kpokwara oku ka enye ohere ka ụmụ Naijiria nọ mba ọzọ nwe ike ịtụ vootu ebe ọbụla ha nọ. Na nkọwa ya inwe ntuliaka kwụ ọtọ bụ ihe ga-eweta ezi ntọala nye ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa idinotu Naijiria. Ifeanyị Ubah: Ụlọikpe enyela iwu ka Inec gbaa jim Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela Inec iwu ka ha cheregodị n'okwu mkpebi ụlọikpe nyeburu ka achutuo Ifeanyị Ubah dịka Senetọ na-anọchite Anambra South. Cheta na ụlọikpe nke Jọstis Bello Kawu no n'isis ya chụtụburu Ubah maka ebubo iji asambodo NECO adgboroja were zọọ ọkwa Senetọ na ntuliaka e mere n'ọnwa Februwarị afọ 2019. Kawu nọkwara n'abali 17 nke ọnwa Jenụwarị afọ jụụ ịkagbu mkpebi e nyeburu n'ikpe ahụ. Grand Slam nke 24 akwaala Serena Williams Serena Wiliams ka na-agba mbọ inweta ntụrụụgo Grand Salm iri abụọ na anọ nke Tenis, oruola mgbe ọ ga-ezu ike? Williams apụọla na asọmpị Tenịs nke Australian Grand slam dịka Wang Qiang meriri ya na-agba nke atọ. Wang jị akara 6-4 6-7 (2-7) 7-5 were merie Williams. Ọ bụ kamgbe 2006 ka agbapụrụ Williams na agba nke atọ na asọmpị Grand slam n'ime afọ iri abụọ na atọ ọ pịawara Lọn Tenisi. Williams emeribuola Wang gbara afọ iri abụo na asatọ n'asọmpị US open na ọnwa Sepụtemba 2019. Williams gbara afọ iri atọ na asatọ na-agba mbọ ịnweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ ya ma Wang abụrụla ya ọgbatauhe. Maka ọkụ Latrik na Naijirịa Ọkụ LAtrik na-anyụ Naijirịa ịkpakụ Gọọmentị Naijirịa na-atụli ma ha a ga-enwụgharị ngalaba niile na-ahụ maka ọkụ latrik n'ihi na kamgbe 2013 enyefere ya n'aka ndị abụghị gọọmentị, ndị Naijirịa nde iri asatọ enwebeghị ọkụ Latrik. Nke a pụtara ihe dịka ha mere nzụkọ National Economic Council n'ụbọchi Tụzde ebe Gọvanọ Kaduna steeti sị na a ga-achọ ụzọ ị dozi nsogbu a ma sị kwa na ngwọta nsogbu a agaghị atọ ọchị. N'Imo steeti Ndị uweojii Ndi uweojii si na ha nwuchiela onye ha si na o bu ya egburu otu nwoke oge ndị isioche ọkpuru ọchichi iri abụọ na asaa mere ngagharịiwe n'imo steeti maka mwepụ ewepụrụ ha? Ha sị na Osuji Sabinus na ndị otu ya kpara mkpa mkpa ga-aga ịzara ọnu ha n'ulọikpe N'Ofesi Nke a bụ maka ndị chọrọ ịga Amerịka mụọ nwa ga-enwe akwụkwọ ikike dịka nwaafọ Amerịka. Onyeisiala Mba ahụ bụ Donald Trump si na atụmatụ ahu abịala na njedebe dịka ha sị na ha agaghị enyezi ụdịri umụaanyi a akwụkwo ha ga-eji baa Amerịka. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51471270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51471270,Muhammadu Buhari: Nkwa o kwere oge nta vootu ọ na-emezubeghi,"N'emume olili Michael Nnadi, bụ nwa akwụkwọ semịnarị ndị ekperima gburu na Kaduna, Bishop Hassan Kukah boro onyeisiala Muhammadu Buhari ebubo na o mezughị nkwa niile o kwere ụmụ Naịjirịa.","Onyeisiala Muhammadu Buhari, nwunye ya Aisha, na osote onyeisiala Yemi Osibanjo na nwunye ya Dolapo n'ogige ịchụ nta vootu n'Ogun steeti na Janụwarị 2015 Kukah, onye bụ onyeisi ụka Katọlik na dayọsis Sokoto, chetara nkwa niile Buhari kwere n'ọgbakọ Chatham House na London n'afọ 2015. Nkwa ndị ahụ gụnyere iwulite ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Dịka Kukah si kwuo, ọnọdụ nchekwa akawanyela njọ mmaji kwuru mmaji n'ọchịchị Buhari a. Bishóp Mathew Kukah kwuru na Buhari bụ okwe nkw eme eme Mana ọbụghị sọ na ọnọdụ nchekwa ka onyeisiala Buharị riri mperi. Ha dị ọtụtụ nkwa ndị ọzọ o kwere oge ọ na-achụnta vootu n'afọ 2015 bụ ndị ọ na-emejupụtaghị. Ha gụnyere: Buhari kwere nkwa imeri Boko Haram. 1) Ịga mba ofesi maka ahụike - Buhari n'onwe ya agaala mba ofesi ugboro ugboro ịga gwọọ onwe ya. Otu aka ahụ kwa, ọtụtụ ndị ọchịchị na-agakwa mba ofesi ịnata ọgwụgwọ. 2) Ikwupụta akụnaụba ya - Buharị kwere nkwa na ya ga-ekwupụta ihe niile o nwere ka o doo ewu na ọkụkọ anya. Mana taa, ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Femi Adesina agọọla na onweghi mgbe onyeisiala kwere nkwa dị etu a. 3) Iwulite ọnọdụ ọkụ latrik - Ọkụ latrik akawanyeghị mma n'ọchị Buharị. 4) Ime ka Naịra siwanye ike - Ọnụ ahịa naịra adaala ugbua karị etu ọ dị tupu Buhari ewere ọchịchị. 5) Ime ka INEC gbadosie ike iji gbochie nrụrụaka na ntuliaka - Na ntuliaka e mere n'afọ 2019, onweghị ihe gosiri na INEC esiwanyela ike. Iji maa atụ, onyeisi INEC yịgharịrị ụbọchị ntuliaka ka ọ fọdụrụ naanị elekere ole na ole ka oge mmalite ịtụ vootu ruo. Nkwa ndị Buhari merela Osote onyeisiala Yemi Osinbajo so ụmụakwụkwọ eri nri 1) Inye ụmụakwụkwọ nri n'efu - Gọọmenti etiti nwere atụmatụ a na-akpọ 'free school feeding'. 2) Inye ndị dara ogbenye bi n'ime obodo puku naịra ise kwa ọnwa - ha kporo nke a 'Conditional Cash Transfer"" Gọọmentị etiti nwere atụmatụ iji nyere ụfọdụ ndị ntorobịa enweghị ọrụ aka 3) Ikepụta atụmatụ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka inwe ọrụ aka - atụmatụ a kpọrọ N-Power na-aga n'ihu ugbua. Nkwa ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ dị n'ime akwụkwọ nke pati Buhari bụ 'All Progressives Congress' wepụtara n'afọ 2015. Ọrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ na-aga n'ihu ugbua 4) Akwa mmiri Naịja nke abụọ - Buharị amalitela ịrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ. A na-atụ anya na a ga-arụcha ya tupu ọ rituo na 2023. Ihe ha kpọrọ akwụkwọ ahụ bụ ""My Covenant with Nigerians"". Ọnụ na-ekwuru Buharị bụ Garba Shehu mechara gọọ na aka Buhari adịghị na mmepụta akwụkwọ nkwa ahụ. Mana nnyocha Premium Times mere gosiri na Buhari na ndị APC binyere aka n'akwụkwọ ahụ n'ezie. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: ""Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa""" afirika-49124342,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49124342,Real Madrid vs atlético Madrid: Bale ga-akwakọrọ ngwongwo ya laa China ka eziri ha onye bụ oke,Diego Costa gosiri ihe ojiri bụrụ onye egwu ọpụrụiche ka onyere ọkpụ goolu anọ iji nyere Atletico Madrid aka tie ogbo ha bụ Real Madrid ezigbote ihe na obodo New York.,"Costa - bụ onye emechara chụpụ n'asọmpị ahụ - nọ n'isi ọkpụ asaa Atletico ji sị Real na ọ bụ ha bụ eze Madrid. Dani Carvajal nke Real Madrid natakwara akwụkwọ mee mee ka anya chawara ndị agba bọọlụ ọbara ọbara na ya bu asọmpị. Real chịtara sọsọ aja atọ mana nke ahụ agaghi ịkasị ha obi maka nke a bụ asọmpị atọ n'aghịrị ha ejighi mmeri laa. Nke a na-abịa na-azụ Bayern Munich na Arsenal gbara ọkpụ abụọ ọkpụ ọkpụ abụọ na-egwuregwu Gareth Bale nyere otu goolu. Okwu Gareth Bale banyere asọmpị a maka ọkwakọwala akpa ya na nkwado ịga otu egwuregwu Jiangsu Suning nke china. O nwere nkwekọrịta ịnọ afọ atọ ebe ahụ. Bale si na ọpụpụ ya bụ ""Maka ọdinma mmadu niile"" Zinedine Zidane bụ onye nkuzi Real Madrid kwuburu na ọ ga-akara mmadụ niile mma ma nwaamadị a chọrọ ụzọ ya. Cheta na Bale bidoro gbawara ndị otu bọọlụ Real Madrid Bọọlu na 2013. Ndị otu bọọlụ Jiang Suning ga-akwu Gareth Bale otu nde Pounds kwa izu. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Egwuregwu na-amasi anyị" afirika-43912787,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43912787,Ndị agha Naịjirịa ebusola Boko Haram agha na Maiduguri,Akụkọ na-eru anyị ugbua na-ekwu na ndị agha Naịjirịa na ndị agha Boko Haram na-ebuso onwe ha agha ugbua n'obodo Maiduguri na Borno steeti.,"Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndị bi na-ebe akpọrọ Jiddari Polo na Maiduguri kwuru na ha na-anụ ụda egbe oge ikpe ekpere bidoro n'abalị a. Ha kwukwara na obi amapuola ọtụtụ mmadụ bi na mpaghara ebe ahụ. Ndị ntaakụkọ AFP kwuru na ndị agha Boko Haram jiri nnukwu ngwa agha bata na bee ndị agha Naịjirịa n'ike, maka ị zọpụta ndị otu ha ndị agha Naịjirịa jichiri n'ebe ahụ. O nwebeghi ihe ndị agha Naịjịrịa gwara ndị ntaakukọ ugbua maka ihe a n'eme na Maiduguri. Ndị ochịehi na ndị ọrụ ụgbo na-enwe nnukwu esemookwu N'akụkọ yiri ibe ya, egbuola mmadụ 27 na Benue steeti ma sunye ọkụ n'ụlọ ekpere ndị otu alakụba abụọ. Ihe a bụ ogbugbu ịji kwụghachị ụgwọ ndị ụkọchukwu abụọ uka Katolik na mmadu 16 ndị ochịehi jii egbe gburu n'ụbọchị ole na ole garaaga. Ndị isi obodo ihe a mere ekwuola na ha ga-elị ndị nwụrụ taa. Ndị uweojii kwukwara na udo alaghachịala azụ n'obodo ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49142678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49142678,Anyị agaghị amachị ndị Shia ife ofufe ha - Buhari,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na atụmatụ ụlọ ikpe ukwu dị n'Abuja weputara maka otu akpọrọ ""Islamic Movement of Nigeria"" (IMN) abụghi maka ndị ofufe Shia.","Eji Sheikh Ibrahim El-zakzaky kemgbe afọ 2015 Ụlọikpe ahu n'Abuja kpebiri na gọọmentị Naịjirịa nwere ikike itinye aha IMN n'ime akwụkwọ ndị na-eyi obodo egwu - Bu nke Bekee kpọrọ ""Terrorists"". Ndị otu IMN - bụ otu ndị ofufe Shia - na-eme ngagharị iwe kemgbe afọ 2015 gọọmentị Buhari nwụchịkọrọ onyeisi ha bụ Ibrahim el-Zakzaky. Gọọmentị ji el-Zazkzaky agbanyeghi na ulọikpe enyela iwu ka atụghapụ ya. Dayo Akata bụ onyeisi ndị ọkaiwu Naịjirịa gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ụlọikpe enyeal ha ikike imachị otu IMN. Mana, ọnu na-ekwuru ndị IMN bụ Ibrahim Musa gwara BBC na ha amatabeghị maka atụmatụ a, mana ya bugoduru eziokwu, ọgaghị eme ka ha kwụsị ime ngagharị iwe maka onyeisi ya e ji. Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ha ga-esoro ihe ụlọikpe kwuru maka IMN, aman onweghi etu atumatu ahu ji metụta ndị ofufe Shia. ""Enwere nde kwa nde mmadu sonyere n'ofufe Shia na Naịjirịa achọghị nsogbu ma ncha. Gọọmentị na ha adịghị ese okwu. Onweghi onye ga anọchịrị ndị a n'ụzọ ime ofufe ha,"" bụ ihe Maazị Shehu kwuru. O kwuru na ọ bụ ""ịmachị ihe IMN na-eme ka gọọmneị chọrọ ime."" Abubakar Malami bụbụ Minista na-ahụ maka Ikpe na Onyeisiala Buhari Ihe Ụlọikpe Kwuru Akwụkwọ si ụlọikpe Ọkaikpe Tionye Maha kpebiri na ""site ugbua gawa, onweghi ihe mere a ga-eji nye ụfọdụ mmadu ohere ịkpọ onwe ha Shia."" O kwuru na ụlọikpe nabata arịọrịo onwetere ịmachị otu ahụ si n'aka gọọmentị etiti Naịjirịa. ""N'iji machie otu a, ulọikpe na-enye Minista na-ahụ maka ikpe iwu ka edepute imachi a n'ime akwụkwọ mgbasa ozi abụọ dị na Naịjirịa."" Ndị IMN malitere ime ngagharị iwe n'afọ 2015 n'Abuja nakwa ebe ndi ọzọ na Naịjirịa. N'izu gara aga, mmadụ 11 so n'otu ahụ nwụrụ mgbe hau na uweojii zutere. Ndị uweojii na-ebokwe ha na ha gburu otu onyeisi ndị uweojii n'Abuja. A na-ele anya na gọọmentị Naịjirịa maọbụ ngalaba na-ahụ maka ikpe ga-ekwupute mmachị IMN. Nke a mee, IMN ga-abụru otu abụọ gọọmentị machịrị, dịka ha machiri otu ""Indigenous Peoples of Biafra"" nke eji Ipob mara n'afọ 2017." afirika-43865296,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43865296,Kedu ihe mere ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ mgbere n'Amerịka?,Ọtụtụ ndị na-anọchịte anya gọọmentị Naịjirịa atụrụanya na ha nọ n'ọgbakọ ụlọọrụ na-ahụ maka Naịjirịa na mba Amerịka haziri n'obodo Washington DC egosịghị ihu na ya bu emume.,"Yemi Osibanjo so na ndị aha dị n'akwụkwọ eji hazie ha bụ nzụkọ Ọbịbịa ndị gọọmentị ahụ abịaghị mere ka ndị mmadụ na-enwe ịtụnanya na Naịjirịa agaghị enweta ntunye ego site na mba ofesi. Ndị kwesiri ịga ebe ahu gunyere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun, mịnịsta nke mmanụ agbịdị bụ Ibe Kwachukwu, mịnịsta nke ọrụugbo bu Audu Ogbeh, mịnịsta nke tecknụzụ bụ Ogbonnaya Onu, mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed, mịnịsta nke okwute ndị bara uru bụ Kayode Fayemi na mịnịsta nke mgbere bụ Okechukwu Enelamah. Otu onye ihe a ndị gọọmentị mere na-ewute bụ Eze ndị Kano Sanusi Lamido, bụ onye rụbụrụ ọrụ ka onye nhazi ụlọakụ ukwu na Naịjirịa. Ihe Sanusi kwuru Sanụsi kwuru na onye na-akwado itinye ego n'Afịrịka, ""o nwere Naijirịa, onwere Gana, o nwere Rụwanda, Kenya na Sawụt Afịrịka"". Ọ gakwara n'ihu kwuo, ""Naịjirịa nwere ike karịa ndi ọzọ niile n'ịtụ mgbere, mana o nwere ike sị kama ya ga etinye dọla 500 na Naịjirịa, ka m tinye dọla 100 na Ghana, dọla 100 na Rụwanda, dọla 100 na Code Vuwa, ka o nweta nrite mgbasa aka."" ""Anyị gara ka anyị na ndị nwere ego ha na-etinye na mba mee nzụkọ, anyị kwesiri ibido na elekere itoolu, anyị wee bido na elekere iri. Mgbe m ruru ebe ahụ, ha kpọrọ m ga n'ụlọọrọ onye na-anọchịte anya Naịjirịa. Ndị bịara nzụkọ ahụ nọ ebe ahụ, osote onyeisiala anọghị, ndị mịnịsta anọghị,"" Sanusi kwuru. Sanusi sị na ihe a mere adịghị mma, maka na ọ na-egosi na Naịjirịa adịbeghi nkwadobe maka ihe a na-ekwu okwu ya. O kwuru, ""Unu kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa nụrụ etu e si atụ mgbere na Naịjirịa, mana unu abịaghị. Ọbụghi etu a ka esi enwete ndị ga-etinye ego na Naịjirịa. Ya bụrụ na ọ bụ ndị Rụwanda haziri ọgbakọ a, onyeisiala ha bu Kagame ga-anọ ebe ahụ na-agwa ndi mmadụ bịawa Rụwanda. Ndị mmadụ tinyekwere ọnụ n'okwu a na soshal midia. Onye nwere akara @SegunAndrews kwenyere n'ihe Sanusi kwuru. Mana, gọọmentị ekwuola na ọbụghị etu a ka ha bụ ihe siri ga. Laị Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi zipuru ozi na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na ndị kwesịrị ịga ya bụ nzụkọ agaghị. Mohammed na-akọwa na ndị mịnịsta aha ha dị n'emume a enwetaghị akwụkwọ e ji si ha bịa ya, maọbụ nọdụ na Washịntịn DC mgbe ọgbakọ a na-eme. O kwuru na mịnịsta ọrụugbo, nke ọkụ latrik na ọrụ na nke okike ego na-ahazi enwetaghi akwụkwọ agbanyeghị na aha ha dị n'akwụkwọ ndị ga-ekwu okwu na ya bụ ọgbako. Mịnịsta nke mgbere na onwe ya so onyeisiala gawa nzụkọ ndị na-achị mba ndị so na Commonwealth bi na London. Mịnịsta na-ahu maka ego nọ na Washịntịn DC, mana ọ bụ maka nzụkọ ndị ụlọakụ ụwa na IMF. Ọ gakwara n'ihu kwuo na mịnịsta na-ahu maka mgbasa ozi na omenala nwetere akwukwọ, mana ọ zara ya were gwa ndị na-ahazi ọgbako a na ya agaghị aganwu maka ihe ndị ọzọ aka ya di na ya. Lai Mohammed kwuru na ""Ihe ndị a gosiri na e kwesịghị ikwu na ndị Minista ekweghi ịga ya bu nzụkọ." afirika-53512239,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53512239,"'Godswill Akpabio kwuo eziokwu, gosi ihe akaebe, agbagharịzịla' - Sinetọ Nwaoboshi na Anyanwu",Sinetọ Peter Nwaoboshi na Sinetọ Sam Anyanwu asaala ebubo nrụrụaka e boro ha n'ihe gbasara Niger Delta Development Commission (NDDC).,"Nwaoboshi na Anyanwu bụ mmadụ abụọ so n'ime aha ndị Godswill Akpabio bụ minista na-ahụ maka ọdịmma Niger Delta wepụtara sị na ha so keta ọrụ ngo, kwuru sị na Akpabio boro ha ebubo ụgha. Nwaoboshi gwara BBC Igbo sị na Akpabio na-agba okwu okirikiri, na ebe ọ sị na o nyere ya ""contract"", na ya wepụta ihe akaebe gosiri nke a. Anyanwu na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mgbaokpuru ka Akpabio na-agba ya n'ihi na ọ bụ onye pati People's Democratic Party (PDP). Otu ihe ha abụọ kwukọrịtara n'agbanyeghi na ha na BBC Igbo kpara iche, bụ na ha ga-akpụpụ Akpabio ụlọikpe, n'ihi na o wepụtaghi ihe akaebe gosiri na ha nwetara ""contract"". Anyanwu kwuru sị na oge ọ nọ n'ụlọomeiwu nke a kpọrọ ""8th assembly"", na ọ zọtaara ndị ọ na-anọchite anya ""contract"" ka e nwee ike rụọ ụzọ dị ebe ahụ, na ọ bụghị n'aha nke ya maọbụ ụlọọrụ ya ka o ji zọta ya. Gee ihe ha gwara BBC Igbo n'uju ebe a: 'Godswill Akpabio gosi akaebe' - Sen. Nwoboshi na Sen. Anyanwu Akpabio kụwara akụoyibo nsugbe Minista na-ahụ maka ọdịmma Niger Delta bụ Godswill Akpabio azaghachila ndị ụlọomeiwu na-eme ya nyocha gbasara ebubo o boro. Ọ kọwara na ọ bụghị ndị ụlọomeiwu nke agba a bụ 9th Assembly na Bekee ka ọ tụrụ aka mgbe o kwuru okwu ""60% contracts"". Nke a so n'ihe o dere n'ime akwụkwọ nkọwa nke onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila jụrụ n'aka ya dịka o mechara ebubo ahụ mgbe a na-enyocha ya. Lee ihe nwereike ima dịka oge ndị omeiwu nyere Akpabio gara Dịka ụbọchị abụọ Femi Gbajabiamila nyere Minista na-ahụ maka ihe gbasara Niger Delta bụ Godswill Akpabio ka ọ wepụta aha ndị omeiwu ọ kwuru na ọ bụ ha na-erite ihe ruru passentị iri isii ọrụ ngo n'aka ngalaba NDDC gachara, ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ịmata ihe ga-eme ugbu a. Cheta na gọọmentị hiwere nzụkọ ga-eme nyocha dịka a na-ebo ngalaba NCDC ebubo nrụrụaka ruru ijeri narịa iri asatọ na otu na ụma. Ihe mere na nzukọ nnyocha ahụ Niger Delta Development Commission (NDDC) bụ ngalaba gọọmentị hiwere iji hụ na mpaghara Niger Delta bụ ndị e si n'ala ha amịpụta mmanụ agbidi na-erite ụrụ na ya. Eboro NDDC ebubo nrụrụaka nke mere ka gọọmentị Naijirịa hiwe nzụkọ ga-eme nyocha ka a mata nke bụ eziokwu. Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka emere ya bụ nzụkọ nyocha. Kama mgbe a na-agba ọnye nọ dịka onyeisioche ngalaba NDDC bụ Kemebradikumo Pondei ajụjụ ọnụ maka ya bụ nrụrụaka ka o koropuru maka ahụike. Daniel Pondei, onyeisi NDDC dara n'ihi ọkụ a chara ya na nycoha ebubo nrụrụaka. A kpọgara mazị Pondei ụloogwụ were bido ịgba Minista Godswill Akpabio ajụju maka ebubo nrụrụaka. Ọ bụ mgbe a na gba ya ajụju maka etu NDCD siri mefuo ego ka o kwuru na ọ bụ ndị ụloomeiwu kacha erite elele site n'ọrụ ngo ngalaba ahụ na-enye ha. Akpabio kwuru sị ""anyị nwere akwụkwọ na-egosi na ọtụtu ọrụ ngo ndị NDDC nyere bụ ndị ụloomeiwu kacha rite na ya"". Okwu a kpasuru onyeisi ndụ uloomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila iwe nke mere ka onye Akpabio ụbọchị abụọ iji kpọpụta aha ndị ụlọomeiwu o kwuru na-erite uru n'ọrụ nga ahụ. Akpabio ọ ga-akpọpụta aha ndị a? Akpabio ọ ga-akpọpụta ha ndị a? Dịka ụbọchị abụọ enyere Akpabio ịkpọpụta aha ndi a gachara, ndị Naijirịa na-atụ anya ma ọ ga-akpopụta ya taa bụ Tụzde. Cheta na Akpabio bụbu onye omeiwu tupu onyeisiala Muhammadu Buahrị emee ya minista na-ahụ maka Niger Delta n'afọ 2019. N'otu aka ahụ ka Joi Nunieh bụbu onyeisi ngalaba NDDC boro Godswill Akpabio ebubo nrụruaka dịka ọ nọchara ọnwa anọ n'ọrụ. Nunieh kwuru na ọ bụ Akpabio kpara nkata ka-ewepụ ya n'ọrụ. O kwukwara na Akpabio chọkwara ka ọ ṅụọ iyi nke ga-eme ka ọ hapụ ikwuputa nrụrụaka ọbụla. Joi Nunieh boro Akpabio ebubo nrụrụ na-ịkpa nkata wepụ ya n'ọrụ Kama Akpabio kwuru na ebubo a niile bụ asị ma kwuo na ọ bụ erubeghị ndị ọchịchi isi mere e ji chụọ Nunieh n'ọrụ. N'aka nke ọzọ ka Pondei ekweghị ịza ajụju onyeisioche nyocha ahụ bụ Olubunmi Tunji Ojo jụrụ ya. O kwuru na ọ gaghị aza ajụjụ Ojo n'ihi na aka Ojo adịghị ọcha. Kedụ ihe ndị ụlọomeiwu ga-eme ma ọ bụrụ na ebubo Akpabio bụ asị? Onye okaiwu Naijirịa bi mba Briten bụ Bulama Bukarti gwara BBC na ọ bụrụ na Akpabio akpọpụtaghị aha ndị omeiwu ọ sị na-erite ọrụ ngo n'aka NDDC, na nanị ihe ndị omeiwu nwereike ime bụ ị degara Onyeisiala Buharị akwụkọ ndụmọdụ. Akwụkwọ ndụmọdụ a ga-agwa Buhari ka ọ wepụ Akpabio dịka Minista na-ahụ maka Nigeri Delta. Bukarti kwuru sị ""Kama, nke a bụ nanị ndụmọdụ"". Ọ kọwara sị "" na mbụ anyị ahụla ebe ndị ụlọomeiwu nyere onyeisiala ndụmọdụ maọbụ ntụzị aka mana o meghị ihe ha kwuru"". Bukarti mara atụ sị "" Mgbe e nyere onyeisiala ntụzịaka ka ọ wepụ onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu, ọ kweghị ime etu ha sịrị kwuo"". Ọ bụrụkwanụ na ebubo Akpabio bụ eziokwu? Bulama Bukarti kwuru sị "" ọ bụrụ na ebubo Akpbio bụ eziokwu, ọ pụtara na ndị uloomeiwu ahụ adaala iwu Naijirịa"". Ọ kọwara na nke a megidere iwu ụloomeiwu nke mere na enwereike ịwepụ ha n'ọrụ ma nye kwa ha iwu ka ha weghachi ego ọbụla ha ritere n'aka NDDC. Bukarti kwuru na a ga-akpopụta aha ha niile ka ihere mee ha. O kwuru sị "" ha dara iwu 'Section 24' nke 'Code of Conduct act' nke gbasara ndị ụloomeiwu aka ha nọ na nrụrụaka dị etu a"". Ihe dị mkpa ndị ụlọomeiwu kwesiri ime ma ewepụta aha ndị a. Ghali Umar Na Abba onye bụbo onye omeiwu kwuru sị "" Ngalaba na-ahụ maka emume kwesiri ekwesi nke ndị ụloomeiwu na-eme onye ụlọomeiwu ọbụla eboro ebubo nrụrụaka nyocha"". Ọ bụrụ na ebubo a bụ eziokwu, a ga-enyefe ndị a n'aka ngalaba iwu obodo kwesiri ekwesi. Onyeisiala Muhammadu Buhari o tinyere ọnụ n'okwu a? Dịka ndị ụloomeiwu na ngalaba NDDC na ama onwe ha aka, onyeisiala bụ Buhari ekwuola ka ndị Minịsta niile na ndị ọrụ gọọmentị niile kwanyere ndị ụloomeiwu ugwu ruru ha. Buhari tinye kwara ọnụ mgbe ndị ulo omeiwu ukwu na nke nta nwere nzụko. Dịka ọ dị ugbu a, ndị Naijirịa na-eche etu a ga-esi mee ya bụ okwu na ebubo nrụrụaka ruru ijeri naira iri asatọ na otu na ụma." mba-uba-43834025,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43834025,Onye ga-abụ onyeisi ọhụrụ na commonwealth?,Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha kparịta ụka ị chọputa ma nwaeze Wales a ga-anọchite anaya nne ya dịka onyeisi ga-chi ngalaba jikọtara obodo 53.,"Ezenwaanyị mba England chọrọ ka nwa ya nwoke Charles nọchie ya n'ọkwa Ụbọchị Tọsde ka Ezenwaanyị Briten kpebiri na nwa ya Charles ga-achị otu akpọrọ CHOGM na Buckingham Palace. Ọ si na ọ bụ mmasị ya ka nwa ya Charles chịa CHOGM otu ụbọchị. Mana ya bụ ọkwa abụghị ihe Ezenwaanyị na-ekenye nwa ya maọbụrụ godu na ọ nwụọ. A na-tụ anya na ndị isi oche Commonwealth ga-ekpebi maka onye ga-achị ha ma ha zukọ na Windsor Castle mana enwebeghị ihe gosiri na a ga-ekwupụta ya bụ ihe na nzukọ ahụ. Ọ bụ na-enweghị onye ọzọ nwereike ichi commonwealth? Onye ntaakụkọ BBC bụ James Landale sị na atụọla arọ ka ọkwa ahụ na-agagharị n'etiti ndị isi obodo nọ na Commonwealth. Mana, Onyeisiala Saut Africa Cyril Ramaphosa egbubirila ije ya na nzukọ a na-eme na London ka owere mara ihe kpatara mwakpo a na-eme n'obodo ya. Mwakpo a na-eme n'ugwu Saụt Afrịka ebe ndị ngagharị iwe na-asị ka-enye ha ọrụ, ụlọ obibi na nkwụsị mmerụaka. Kedu ihe bụ ọrụ onyeisi Commonwealth? Ọkwa nke Ezenwaanyị Briten nọ na ya dị oke mkpa. Ngalaba a na-achịkọta mba iri ise na atọ iji wee hụ na ihe njirimara Commonwealth bụ ihe bịara na mmezu. Nke a gụnyere ijikọta mba ndị a site n'azụmaahịa na mmekọrịta mba ụwa niile. Akụkọ ga-amasị gị: Onyeisi otu ndị a na-eme njem nleta na mba niile nọ na otu ahụ, iji mee nkwekọrịta ahụ guzosie ike. O bụ ndị isi otu a na-eme mkpebi onye ga-abụ onyeisi ha gbagburugburu. Praịm Mịnịsta bụ Theresa May na Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau akwadola ọkparaeze Charles ị bụ onyeisi. Gịnị bụ CHOGM? Ọgbakọ nke afọ mere na Lọndọn, ebe nke gara aga n'afọ 2015 bụ na Valletta dị na Malta." egwuregwu-43682547,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43682547,Asọmpi Commonwealth: Naịjirịa agafeela n'agba ọkara-ikpeazụ nke tenisi,Ndị mba Afrịka na-egosi ike ha n'asọmpi Commonwealth a na-eme na mba Australia.,"Segun Toriola nọchikwara anya Naịjirịa n'olympics nke 2016 N'agbanyeghị na Naịjirịa enwetebeghị ihe nrite ọlaedo, ọlaọcha maọbụ ọlanchara ọbụla kamgbe asọmpi nke 2018 a ji bido, olileanyị dị n'oge na-adịghị anya. Ụmụ Naịjirịa bụ Segun Toriola na Olajide Omotayo ji 3-1 merie Australia n'agba kwọta faịnal nke asọmpi tebulu tenisi, nke mere na ha ga-ezute England n'agba semi-faịnal na Monde. Ọ bụrụ na Toriola na Omotayo merie, ọ pụtara na ha ga-eso sọọ mpi nke ngwụcha nke ga-eme ka Naịjirịa nweta ihe nrite ha nke mbụ n'asọmpi nke afọ a. Akụkọ ga-amasị gị Obi dị ndị Naịjirịa mma maka nke a. N'ịkụ ọkpọ Apịapụla otu onye na-anọchite Naịjirịa n'ọkpọ. Samuel Addo bụ onye mba Ghana pịapụrụ Sikiru Ojo ka ha abụọ zutere n'agba nke bekee kpọrọ Bantam weight (56kg)." 52163829,https://www.bbc.com/igbo/52163829,Covid-19 Outbreak: ‘Dike’ isii pụtara n'oge coronavirus a,"Akụkọ a bụ maka mmadụ isii n'ime ha, nwereike ikpalite mmụọ gị.","1)Isi n'uwe e ji achọ mma fee n'uwe ndị ọrụ ahụike Nwaagbọghọ onye dụọdụọ e jiri uwe eji achọ mma mara, esila na ya bụ njirimara ha banye n'ịdụ uwe ndị ọrụ ahụike na mba Libya. Nke a ha na-eme bụ ọrụ akwụ ụgwọ ụmụagbọghọ ndị ahụ ji enyere aka n'oge ugbua, nke ne-emecha ka ha na-arahụ n'ọrụ mgbe ụfọdụ. Ha akwapụtala ụwe ndị ọrụ ahụike iri ise kemgbe ha malitere, ma banye n'ịkwapụta ọtụtụ ọzọ. Ndị ọrụ ahụike Tripoli Hospital jara ha ike maka ọrụ ha. Najwa Taher Shokriy bụ onye nwe ya bụ ụlọọrụ, gwara BBC na ya bụ atụmatụ malitere mgbe otu dọkịnta nke ụlọọgwụ al-Jalaa Hospital nke dị na Tripoli rịọrọ ndị achụmntaego enyemaka. Shokriy bụ onye malitere ịkwa uwe otu afọ gara aga, sị na ọ bụghị ụkpa ekele a na-enye ya ugbua dị ya mkpa, kama na ọ bụ inyere aka maka ibuso coronavirus agha. O kwuru na obi ya dị n'ịkwapụtakwu ọtụtụ uwe ndị ọrụ ahụike, mana enweghị ngwaọrụ na-echere ha aka mgba. 2)Ụlọ onye na-akụ flawa: Ọrịa coronavirus emeela ka a kagbuo ọtụtụ agbamakwụkwọ nke mere na ahia flawa anaghị agazị. Mana ụfọdụ ndị ọrụ ha bụ ikụ nakwa ire flawa n'obodo Paarl, Saụt Afrịka gbakọtara ime ka ya bụ ụsụahịa bụrụ uru. Nke a mere ndị ọrụ Adene Farm jiri were flawa ha chọọ Huis Vergenoegd Old Age Home bụ ebe ndị kara nka na-ebi, mma. Ndị okenye bị n'ụlọ ahụ nọ n'ime ụlọ maka ọrịa coronavirus, mana a hapụrụ ha ka ha pụta gbaara anya ha ekeresimesi n'Epreelụ. Ndị mmadụ na-agafe jakwara ha ike. 3) Otu onye nwe ụlọ sị ndị bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ Onye nwe ụlọ nke Bekee kpọro 'landlord' sị mmadụ iri atọ na anọ bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ n'ọnwa Maachị na Epreelụ n'ihi etu coronavirus si metụta achụmntaego. Michael Munene nwere ọnụụlọ iri abụọ na anọ ebe a na-akwụ ya dọla 30 kwa ọnwa na mba Kenya. 4)Nwaada na-eji afọ agba egwu ji ya eme ndị mmadụ obi ụt Nermine Sfar bụ ote egwu mba Tunisia sị na ya na-ete egwu n'ihe onyonyo iji mee ndị mmadụ obi ụtọ dịka ha nọ n'ime ụlọ ha maka ọrịa coronavirus. Ọ na-ezipu egwu ya ngwa ngwa dịka ọ na-agba ya n'ịntanetị, nke nde kwuru nde mmadụ na-ekiri dịka ha nọ n'ụlọ ha ugbua. Ọ malitere ịgba egwu a tupu e tie iwu mmachibido ndị mmadụ ịpụta ezi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị. 5)Ọgụegwụ enyela ụlọ ya dịka ebe a ga na-elekọta ndị butere ọrịa coronavirus Ọgụegwu mba Itiopia bụ Hamelmal Abate enyela ụlọ ya ka e were ya mere ebe a ga-edowe ndị nwere nje coronavirus. N'ọnwa Maachị, gọọmentị mba Itiopia gwara ndị ọbụla si njem ofesi bata mba ahụ na ha ga-anọ n'ụlọndina ihe ruru izuụka abụọ, bụ nke ha ga-akwụ ụgwọ ya ruo mgbe ha ga-anọcha mmachibido maka nnyocha (quarantine) ha. Abate bụ onye aka ya chawara n'ịgụ egwu kemgbe 1990, gwara onyentaakụkọ BBC bụ Kalkidan Yibeltal na ya bụ atụmatụ dị mma maka ndị ji ego ga-emeli ihe dị n'ime ya. 6)Ọchee goolu kwụrụ ndị mmadụ ụgwọ nr Ochee goolu ndị Plateau United bụ Chinedu Anozie, nyere mmadụ atọ ego nri ka ha were nwee ike ịnọ n'ụlọ n'oge coronavirus a. Chinedu nyere ndị nkwado ya mmadụ atọ puku naịra ise ka ha were 'kụwa abụ' dịka ha nọ n'ụlọ ugbua. Akụkọ ga-amasị gị Coronavirus amaghị onye dị ọcha maọbụ ojii." afirika-44985090,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44985090,Ọgụ mba Kameruun bụ nsogbu ndị Krọs Riva nwere - Ayade,Gọvanọ Krọs Riva steeti bụ Ben Ayade etiela mkpu n'oke olu na ndị Ambazonia chọrọ nwereonwe site na Kameroon na-ebubata ngwaagha na Naịjirịa.,"O kwuru na ndị Ambazonia a na gọomentị mba Kameruun na-esi n'oke karịrị iri abụọ na asaa dị n'etiti Kameruun na Naịjirịa ebubata ngwaagha ndị a. O kwuru nke a na ngwụcha mkparịta ụka nchekwa ha mere na Krọss Riva Steeti ebe ọ katọọrọ ndị ọrụ nchekwa maka nsogbu dị n'oke ha na ndị Kameruun. Mgbe BBC gbara ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ben Ayade bụ Christain Ita ajụjụ, na nke a bụ eziokwu na oke dị n'etiti steeti ahụ na Kameruun enweghi ezigbo nchekwa ọbụla. Kamgbe Ọktoba afọ 2017 ha ndị kwupụtara mnwereonwe bụ ebe nsogbu ha bidoro O kwuru na nke a mere ndị a ji na-abata na Naịjirịa na-ewe ụmụ Naịjirịa n'ọrụ isonye ha lụọ agha dị na kameruun site n'ibunye ha egbe na ngwaagha. Ihe gọọmentị etiti kwesiri ime; O kwuru na gọvanọ Ayade edegarala onyeisiala bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi banyere nke a, na-arịọkwa ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ n'ichekwa oke ndị a. O kwuru na steet na-agba mbọ nke ya site n'ike ajị n'ume ịhụ na-ebelatara oke mpụ nke mbubata ngwaagha ndị a na-ebute. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46525971,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46525971,Sanwo-olu: APC akpọghị Igbo asị,Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Legos steeti n'aha APC bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na nlegara anya ndị Igbo na-ele APC dịka pati kpọrọ Igbo asị abughị ihe ziri ezi.,"Sanwo-Olu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọrọụ ntaakụkọ bụ TVC nwere na Legos ụbọchị Tuzde. O kwuru na ọkwa APC nyere ụmụafọ Igbo abụọ bụ Ben Akabueze, onye rụburu dịka Kọmịshịọna mkpata na mmefu na Joe Igbokwe, onye na-arụ ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru APC na steeti ahụ gosiri echiche ọma APC nwere n'ebe ndị Igbo nọ. End of Twitter post, 1 N'okwu ya, Sanwo-Olu sị, ""Oge m nọ n'ọrụ oyibo, onye kachara nọrọ n'ọkwa dịka kọmịshịọna bụ Maazị Ben Akabueze, onye Igbo, onye rụrụ ọrụ dịka Kọmịshọna na-ahụ maka mkpata na mmefu."" ""N'ezie, ọ bụrụ na ị nọ n'ọkwa Kọmịshịọna na-ahụ maka mkpata na mmefu, ọkwa gị dịka ọkwa osote gọvanọ."" ""Nke a bụ n'ịhị na ndị mịnịstrị ndị ọzọ ga na-abịakwute gị. Ọkwa a bụ ọkwa e nyere enyi m ma bụrụkwa nwanne m nwoke, Ben Akabụeze."" ""Onye rụrụla ọrụ ọtụtụ afọ kachasị dịka onye ojezi otu APC na Legos steeti bụ onye Igbo, Joe Igbokwe."" ""Ọ rụọrọla APC ọrụ ihe karịrị afọ iri na ise. Mgbe i nyerela onye Igbo ọkwa dịka ọnụ na-ekwuru gị, kedụ ihe ọzọ ị na-ekwu?"" Cheta na na e meriri otu APC na mpaghara Oshodi-Isolo, Iferodun-Ajeromi nakwa Amuwo-Odofin, ebe Ndịgbo kacha n'ọnụọgụgụ na ntuliaka ndị nnọchite e mere na 2018. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45873045,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45873045,Hauwa Liman: Ọnwụ ya wutere anyị nke ukwu - Gọọmentị,Ọnụ na-ekwuchietere Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na ọnwụ Hauwa wutere onyeisiala nke ukwu.,"O ziga kwara ndị otu Red Cross ozi itiakanobi maka ọnwụ nwata nwaanyị ahụ bụbu onye ọrụ ha. O kwuru na Buhari nabatara ọnwụ ya dịka ihe si n'aka Chineke mana o kwukwara na gọọmentị Naịjirịa nakwa ndị enyemaka ha na mba ofesi nwara ike ha igbochi ọnwụ Hauwa Liman. Garba Shehu gwara BBC na Buhari nyere ndịisi ndịọrụ nchekwa dị ịcheiche ikike ịme ihe ọbụla ọ ga-ewe iji kpọlata Hauwa na ndị otu ya mana onweghi isi. End of Twitter post, 1 Gọọmentị etiti kwuru na ha nwara ike ha ịzọpụta Hauwa Liman onye ndị Boko Haram gburu ụnyaahụ bụ Monde. Ndị Boko Haram tọrọ Hauwa Liman nakwa Saifura Ahmed, ndị ọrụ gbatagbata mba ụwa a kpọrọ 'International Committee of Red Cross' na Borno steeti n'ọnwa Maachi, afọ 2018. N'akwụkwọ ozi nke Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed wepụtara, o kwuru, na ""gọọmentị mere ihe niile ha nwere ike ime iji zọọ ndụ ya tupu nakwa oge ndị ji ya nyere iji gbuo ya."" Mana ọtụtụ ndị Naịjirịa na-atụ arịrị ma na-ebo gọọmentị ebubo ume ngwụ sị na a gaara azọpụta nwa ada ahụ ma ọ bụrụ na gọọmentị mere ihe o kwesiri. Oby Ezekwesili onyeisi otu 'Bring Back Our Girls' bere anya mmiri. O kwuru na obi mgbawa n'ọnwụ nwa ada ahụ churu ya ụra. Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki katọrọ ogbugbu Hauwa. Atiku Abubakar kwuru na ọ bụ ihe obi mwute na ogbugbu egburu Hauwa ma rịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ zọpụta Leah Sharibu na ụmụaka niile ndị Boko Haram ji. Gọvanọ Gombe steeti bụ Hassan Dankwado gosikwara obi mwute. Demola Olarewaju kwuru na Naijiria na Buhari gbahapụrụ Hauwa ka ọ nwụọ. Maureen Kabrik kwukwara otu ihe ahụ. Chima Matthew Amadi kwuru na Naijiria gbadoro anya na okwu ndọrọndọrọ ọchịchị hapụ Hauwa ya anwụọ n'aka ndị Boko Haram. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43736422,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43736422,Buhari adọtịala ụbọchị nkwupute ihe onye nwere,Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka a dọtịa ụbọchị eji emecha nkwuputa maka ihe onye nwere na ụtụisi.,"Buhari ka na-ekwe nkwa mmụbanye akụnaụba ala Naịjirịa O kwuru ka ewega ya n'ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Juun, site n'ụbọchị iri atọ na otu (31) nke ọnwa Maachị ọ kwesịbụrụ ịgwụ. Onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa puruiche n'ihe gbasara akụkọ na mgbasa ozi bụ Femi Adesina kwuru na Buhari kabiri iwu ngalaba na-ahụ maka ntụkọta ego ala Naịjirịa a kpọrọ 'Federal Inland Revenue Service' na bekee mana o kwukwara na a naghị a dọtị oge a ọzọ. Cheta n'ime ọnwa Dizemba, onyeisi ụlọọrụ FIRS bụ Babatunde Fowler kwuru na ụtụisi a nyere Naịjirịa ijeri naira iri na asaa n'etiti ọnwa Juun na Dizemba n'afo 2017. Adesina kwuru n'ime akwụkwọ-ozi a nyere ndị ntaakụkọ na gọọmentị mmere nkpebi a makana ha nwere olileanya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-ekwupute ihe ha nwere. N'ọnụokwu Buhari: ""ọ dịghị mma na Naịjirịa anaghị eme ọfụma na ihe gbasara ụtụisi na Afịrịka."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48037025,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48037025,Chris Ngige: A tụgharịrị ihe m kwuru maka ndị dọkịta,Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige agọọla ụkwụ n'aka ya na ihe a sị na ya kwuru maka ndị dọkịta abụghị etu ya siri kwuo ya.,"Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa N'ozi nke onye nnyemaka n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Nwachukwu Obidiwe wepụtara, ngige kwuru ka ihe ya kwuru bụ na ndị dọkịta anaghị enwe ohere ọzụzụ na Naijiria nke mere ha ji aga alabekee maka ịgụwanye akwụkwọ iji bụrụ ọkaibe n'ọrụ ha. Ọ gara n'ihu kwuo nke bụ ihe ọma nyere Naijiria dịka ha na-ezilata ego na ihe ha mụtara n'ala bekee. ""E wezuga okwu na Naijiria emezughị ntuziaka WHO na e kwesiri iwe dọkita nye mmadụ nari isii ọbụla, ihe ọbụla m kwuru bụ eziokwu gba ọtọ nke onye ọbula kiri mkparitaụka ahụ n'uju ga-ekwenye na ya."" ""Agbanyeghị na gọọmenti etiti agbaliala n'ebe ahụike, Naijiria erubeghị ebe ọ kwesịị ịnọ. Ugbua anyị enweghị ụlọọgwụ zuru ịnabata ndị dọkita chọrọ ọzụzụ pụrụ iche(residency) dịka naanị pasent 20 na enweta ohere."" ""Nke a pụtara na nwere ikike ịga alabekee maka ọzụzụ,bụrụ ọkaibe, na-arụ ọrụ ma na-ezilata ego ụlọ."" Cheta na mkparịtauka ya na ndị ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere na Wenezde, Ngige sị na obi anaghị amapụ ya maka akụkọ na ndị dọkịnta na-apụ aga mba ofesi n'ihi na ndị dọkinta enwere na Naịjirịa zuru ezu. Ngige sị, ""Ọnaghị amapụ m obi. I nwee ọtụtụ, izipu. Ha na-apụ, mụta ọrụ nke ọma, ma na-ezitekwa ego n'ụlọ."" Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị dọkịnta bekee bụ ""Nigeria Medical Association"" bụ Francis Adedayo Faduyile tinyere ọnụ n'ihe mịnịsta na-ahụ maka ọrụ kwuru maka ọnọdụ ndị dọkịta na Naịjirịa. Dọkịnta Faduyile sị na okwu a Ngige kwuru gosiri na ọ maghị etu ihe kwụụ ugbua. Ọ sị, ""Ọ bu eziokwu na Ngige bụ Dọkịnta, mana nke a apụtaghị na ọ ma ihe na-eme ugbua. Kedụ mgbe ọ rụrụ ọrụ dịka dọkinta? Ọrụ eji mara ya ugbua bụ Mịnịsta. Anyị nwereike kwuo na uche ya adịghịzị n'ihe a na-eme banyere ọgwụgwọ ahụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na Ngige ma etu o si kwụrụ ugbua, ọ ga-ama na ihe kwesiri ị bụ omenala bụ na mmadụ 600 kwesiri ike otu dọkịnta, ""Ihe anyi nwere na Naịjirịa bụ mmadụ 6000 n'otu dọkinta."" Faduyile sị; ""Ọ dị ka ihe Ngige na-arụtụ aka bụ ohere gọọmentị steetị na nke etiti wepụtara iji wee ndị dọkịnta n'ọrụ. Ohere a epeka."" Ọ sị na enwereike agaghị ata Ngige ụta maka ọmaghị maka ihe akpọrọ ""Abuja Declaration"" ebe aka na-achi mba dị iche iche n'Afịrịka kwekọrịtara na pacent 15 nke bọọjetị ga-abụ maka ahụike. ""Naịjirịa enyetubeghi pacenti isii mbụ. Ihe anyị na-eru bụ ise. Afọ gara aga bụ pacent atọ na ọkara. Afọ 2019 bụ pacent atọ na ọma asatọ."" Faduyile sị na ahụike ndị Naịjirịa dị ha mkpa, mana ọtụtụ ndị nọ na gọọmentị na-eme ka ọmasịghị ha makana ha nwere ohere ifepu ga mba ofesi ga nata ọgwụgwọ. Ọtụtụ ndị Naịjirịa nọ na soshal midia tunyere ọnụ na nke a. Onye nwe akara @monye_morris juru etu Ngige jiri bụrụ onye eji eme akaja: Onye ji akara @AOJ_Jesse sị na Ngige kwuru okwu ka onye na-ere ahịa n'Alaba. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50809108,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50809108,Anambra Christmas Decoartion: 'Ọ bụghị gọọmentị na-emezi Anambara maka ekeresimesi',Gọọmentị Anambra Steeti akọwaala ihe gbasara ebubo oke mmefu ego ndị mmadụ na-ebo gọvanọ Willie Obiano.,"Otu a kpọrọ 'Human Rights Liberty Access and Peace Defenders Foundation' (HURIDE) kwuru na Obiano wepụtara ihe karịrị otu ijeri naira iji chọọ Anambara Steeti mma maka ekeresimesi. Onyeisi otu ahụ bụ Dede Uzor kwukwara na ego ahụ karịrị ego gọọmentị ji arụ ọrụ mmepe ndị ọzọ na steeti ahụ. Mgbe BBC kpọtụụrụ Uzor, ọ kọwara na ọ bụ na Soshal Midịa ka ha nwetere ya bụ akụkọ. Ọ kọwakwara na gọọmentị ekweghị akọwara ha nke ọma mgbe ha jụrụ ese maka ebubo ahụ. Ihe gọọmentị Anambra steeti kwuru Don Adinuba Mana Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasa ozi n'Anambra kwuru na ebubo ahụ niile bụ asị ọcha. Adinuba jụrụ sị: ""Ego ole ka Anamabra steeti na enweta n'ọnwa ha ga-eji mefuo otu ijeri naịra na ụma maka ndozi ekeresimesi?"" Adinuba kọwara na Anambra steeti na agba mbọ ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa, na gọọmentị enweghị ego ha na-emefu emefu. O kwuru na ọbụ ụloorụ dị iche iche na enye aka imezigasị ebe ụfọdụ na steeti ahụ maka ekeresimesi. Kọmishọna ahụ kwukwara na ọbụ aka chịburu steeti ahụ bụ Peter Obi na-agbasa asịrị na Obiano na-emefu ego n'ụzọ ekwesịghị ekwesị. O kwuru na ọbụ Val Obi bụ onye enyemaka Peter Obi depụtara ya bụ akụkọ ụgha. Ihe Val Obi kwụrụ Peter Obi bụ aka chịburu Anambra Steeti Mgbe BBC kpọrọ Val Obi, o kwuru na aka ya adịghị n'akụkọ ahụ. N'okwu ya: ""Onye sị na onwere ihe m dere, onye ahu wepụta ya."" Obi kwuru na onweghị etu mmefu ego goomentị si gbasata ya. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasị gị: 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife" afirika-46667793,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667793,"Williams Uchemba: ""E ji aha m anapụ ndị mmadụ ego""",Akụkọ pụtara na twitter gbasara Williams Uchemba ka onye na-ekwuchitere ndị a na-emegbu ọnụ ha bi na mba America kwuru na Williams ji aha ndị United Nations were na anapụ ndị mmadụ ego.,"Williams Uchemba bidoro na nwata na-akpa ndị mmadụ obi anụrị site n'ihe nkiri ọ na-eme mgbe ahụ Ya bụ okwu ruru ọtụtụ ndị ntị na akara Twitter na Instagram. Ufọdụ ndị ekwuola na ihe onye mgba okpuru ahụ kwuru bụ eziokwu , ụfọdụ ndị kwukwara na ọbụghị ịhe Uchemba pụrụ ịme. @Vickie92205767 kwuru na ndị aghụghọ juru n'akara soshal midia nke nwereike imetụta Uchemba End of Twitter post, 1 @LodNod kwuru na etu ndị mmadụ si kweta akụkọ nrụrụaka a na-ewu na soshal midia gosiri na Naijiria nwere ọtụtụ ihe dị mma anaghị atụnanya makana oteela Uchemba ji mewe ihe ọma ha ahụbeghị. @Amchizzy kwuru na ọyị ya akọrọla ya maka Uchemba etu aka ya esighị dị ọcha. @bimbo_cash kwuru na o kwetere na Uchemba mere udiri ihe di etu a. Uchemba bụ onye ama ama n'enye ndị ogbenye onyinye di icheiche site na otu ọ kpọrọ #givechallange, na-emekwa ihe ọchị na akara instagram ya. Ka akụkọ a kpụ ọkụ n'ọnụ, onye n'ekwuchite ọnụ ndị UN apụtala katọọ ndị ji aha ụlọ ọrụ ha anapụta ndị mmadụ ego. Ha kwuru na ụlọọrụ ndị UN enweghị ike ịnara onye ọbụla ego were nabata ha na nzukọ ha. Uchemba apụtala kwuo na ọ bụghị ya na anara ndị mmadụ ego, na ọ bụ ndị ohi ji aha ya anakọrọ ndị mmadụ ego. O kwukwara na onweghi ịhe gbasara ya na ndị United Nations na agbanyeghị na aha ndị UN dị na akara soshal media ya. Ọtụtụ ndị agaala na akara soshal media Uchemba, ebe o gọnarịrị okwu ndị a were n'ebo ya ebubo ohi. Uchemba ekwubeghi okwu ọzọ gbasara ya, o wetubeghikwa aha ndị UN n'akara Instagram ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49776228,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49776228,Election Tribunal: Mmeri Ihedioha bụ mmeri si na Chineke - Chibuike Onyeukwu,Ụlọikpe nọ n'Abuja eweliela aka Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ nke ọnwa Maachị afọ a.,"Ụlọikpe ahụ tụpụrụ ikpe nke Uche Nwosu, Hope Uzodinma nakwa Ifeanyi Ararume gbakọrọ aka kpee Ihedioha. Ha kwuru na ihe ha ji tụpụ ya bụ ikpe bụ na ọ baghị uru maọbụ o nweghi ""Merit"" na Bekee. Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka Ihedioha etinyela ọnụ n'okwu gbasara mmeri a Ọ gwara BBC Igbo na mmeri a kwesiri ịbụ ohere mmadụ niile ga-eji bịakọta ọnụ ka edozie Imo steeti. O kwuru na ihe chere ha n'ihu ugbua bụ ọganihu Imo steeti nakwa etu a ga-esi buli ya n'ọnọdụ dị mma. Mmadụ atọ gbara akwụkwọ nke taa bụ Hope Uzodinma Uche Nwosu na Ifeanyi Ararume. Ha boro ebubo na mmeri Ihedioha dara iwu na-achịkọta mmeri ntuliaka na Naijirịa." afirika-53558638,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53558638,Hepatitis: Gịnị ka ọ bụ?,"Dịka ụwa niile na-echeta ihe gbasara ọrịa Hepatitis taa, ọ dị mma ka ị mata na ọrịa a abụghị obere ihe.","Nke a mere ngalaba World Health Organisation ji họpụta ụbọchi 28 nke ọnwa Julaị afọ ọbụla maka ọrịa Hepatitis. Isiokwu nke afọ 2020 ka ha kpọro ""Hepatitis-Free Future"" ya bụ ""Ọdịnịhụ na-enweghi Hepataịtis"". Gịnị bụ ọrịa Hepatitis? Ngalaba WHO kọwara na Hepatitis bụ ọrịa imeju, a na-akpọ ya ọrịa ịbaọcha n'anya n'Igbo. Ọ bu nje virus kacha ebute ọrịa Hepatitis kama ihe ndị ọzọ dịka mmanya na-aba n'anya na mgbe ahu madụ na-aluso ya ọgu nke bekee kpọrọ auto immune disease na-ebutekwa ya. Ọrịa Hepatitis di icheiche kama ọ bụ ise kacha enye nsogbu n'ụwa niile. Ha bụ Hepatitis A, B, C, D na E. WHO kọwara na Hepatitis A na E bụ site na nri maọbụ mmiri na-adịghị mma ka esi ebute ya. Ebe Hepatitis B, C na D bụ site na mmiri maọbụ ọbara si n'ahụ mmadụ banya ahụ onye ọzọ ka e si na-ebute ya. BBC Igbo kpọtụrụ Dọkịta bụ ọkammụta maka imeju bụ Dkt. Uchenna Ijoma ka ọ tinye ọnụ n'ihe gbasara ọrịa Hepatitis. "" Ọ dị mkpa ka mmadụ niile mee nyocha maka ọrịa Hepatitis"", Dkt Ijoma Dkt. Ijoma kọwakwara na ọ bụ ọrịa na-arịa imeju. Ọ kọwara na Hepatitis B na C bụ ndị akacha elebe anya maka ha kacha egbu ime ahụ mmadụ ma na-ebute kwa ọrịa ndị ọzọ. Ijoma kwuru ihe na-ebute Hepatitis Dọkịta Ijoma kọwara na-enwere ụfọdu ihe na-ebute ọrịa ịbaọcha n'anya, ọ kpọpụtara ha nke gụnyere: 1. Oke mmanya - Ijoma kọwara na oke mmanya na-ebute ọrịa Hepatitis. Foto na-egosi imeju oke mmanya butere ọrịa Hepatitis Ọ kọwara na ịṅụfe mmanya ọkụ oke na egbu imeju nke kacha ebute ọrịa Hepatitis. 2. Ọgwụ na-ebute kwa Hepatitis Dkt Ijoma kọwara na ụfọdụ ọgwụ eji agwọ ụkwara nta na nke Bekee kpọrọ anti-biotics na-ebute Hepatitis. Dkt Ijoma kwuru na ọdịghi mma ka mmadụ jiri aka ya enye onwe ha ọgwụ Ọ kọwara na ọbụghị na ọgwụ ndị a adịghi mma, kama ahụ mmadu dị n'iche n'iche nke mere na ọ dị mkpa ka ọ bụrụ dọkịta nyere mmadụ ọgwụ. 3. Ọgwụ mgbọrọgwụ Ijeoma kọwara na ọ bụghị na ọgwụ mgbọrọgwu niile di njọ kama ọtụtụ n'ime ha enweghị ọnụ ọgwụ nke Bekee kpọrọ dose. Ma tinye kwa na ọtụtụ ha na-eji mmanya ọkụ aṅụ ọgwụ ndi a. O kwuru sị ""Ihe ndị a na-eme ka mmadụ nwee ike ibute ọrịa Hepatitis"". Ị makwa ọrịa ndị i kwesiri igbochi n'oge udu mmiri a? 4. Ọrịa sitere n'ime ahụ nke Bekee kpọrọ auto-immune. Dọkịta Ijoma kọwara na ụfọdụ mgbe, na ahu mmadụ na-alụsọ ime ahụ onye ahu ọgụ. Ọ mara atụ sị ""ụfọdụ mgbe ahụ mmadụ nwereike na-ahụta imeju ahụ gi ka ọ bụghi nke kwesiri ekwesi, nke a ga-eme ka ahụ mmadụ na ọbara eji achụ ọrịa bido lụsa imeju onye ahu ọgụ"". Ọnọdu dị otu a, na-ebute ọrịa bekee kpọrọ auto-Immune Hepatitis. 5. Ibu oke ibu Oke ibu maọbụ ọrịa shuga na enyere aka ebute kwa ọrịa Hepatitis. Nke a na-ebute ọrịa Bekee kpọrọ non-alchoholic fatty liver disease. Ijoma kọwara asị ""ọ bụghi mmanya na-ebute ụdịrị ọrịa a, kama otu ihe na-ebute ya bụ oke ibu maọbụ ọrịa Shuga na ebute ya bu ọrịa"". Ọnọdu a na-ebute ọrịa ịba ọcha n'anya. Dokịta Ijoma kwuru sị ""Ihe mere ndị ahụike ji etinye anya na Hepatitis B na C bu maka na ha nyecha mmadu ọrịa nke akpọro Acute Hepatitis na bekee, ha na-atọtị ya manye kwa mmadụ nke a na-akpo chronic Hepatitis"". Ijma kọwara na Chronic Hepatitis bu mgbe ọrịa a na-egbu imeju mmadụ nke na-eme ka ọnodụ ọnye ahu kawanye njọ ma bute ọrịa Liver cirrhosis, Imeju ịda mba maọbụ Kansa imeju. Ọ kọwara na ọrịa atọ a na-esi ike ịgwọta nke mere na ọ ka mma ka egbochie ha maọbụ chopụta ha n'oge. Kedụ etu mmadụ si ebunye onye ọzọ ọrịa Hepatitis? Dọkịta Ijoma kọwara na ụzo esi ebute ọrịa ịgbaọcha nanya dị iche iche, ha bụ Ọ dị mkpa ka enyochaa ọbara tupu etinye ya n'ahu mmadụ. Ijoma kọwara na ọ di mkpa ka enyocha ọbara nke ọma tupu etinye ya n'ahụ onye ọzọ. Ọ kọwara na mmadụ na mmadụ iji otu ihe dịka agụba, Ngịga, ịka ichi na ihe ndị ọzọ. O kwuru sị "" Ihe ọbụla na-ewepụta ọbara ekwesịghi ka mmadu abụọ nwere ya"". 2. Nne na-ebunyekwa nwa "" Ndị ọrụ ahụike kwesịrị ịgba ọgwụ mgbochi Hepatitis"", Dkt IJoma Nne nwere ọrịa hepatitis nwereike ibunye ya nwa ya mgbe ọ na-amụpụta ya. Nke a bụ na a na-enwe ọtụtụ mmekọ ọbara nke nwereike ime ka nne bunye nwa ya ọrịa Hepatitis. 3. Mmekọ nwoke na nwaanyị Ijoma kwuru na a na-esikwa na mmekọrịta nwoke na nwaanyị ebute ọrịa Hepatitis. Kama ọ kọwara na nke a esoghi na ụzọ ọrịa kachasị si efe kama o di mkpa ka ndi mmadụ mara na e si na ya ebufe ya bụ ọrịa. Kedụ etu mmadụ ga-esi gbochie ibute ọrịa Hepatitis? Dọkịta Ijoma kwuru na ụzo kachasi di ire bụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Hepatitis ọkachasị ndị ọrụ ahụike. O kwukwara na onye ọbụla onye ezinụlo ha butere ya bụ ọrịa gbalịa gbaa ọgwụ mgbochi Hepatitis. Ijoma kwuru si ""Mmadu ekwesịghiike ihe ọbụla na-emeputa ọbara ma ka onye ọbụla hapu ịṅụ oke mmanya"". Gịnị bụ njirimara ọrịa Hepatitis? Hepatitis na-abịa n'ụzọ abụọ nke bekee kpọrọ Acute na Chronic Hepatitis. Ijoma kwuru "" Acute Hepatitis ga-arịa mmadụ ahụ ọkụ , anya gị achaa odo odo, o ga-akujisi mmadụ ahụ, Ike ọgwụgwụ ma nwee kwa ike onye ahu a na-agbọ agbọrọ, ma etu nsi si acha agbanwee"". Dọkịta Ijoma kọwara na ọtụtụ ndi mmadụ na arịa Acute Hepatitis ma si na ya gbakee. Kama o kwuru si ""ihe dịka passentị iri itolu (90%) ndị bu Chronic Hepatitis anaghi ama n'ihi na ọ naghị egosi n'ahụ mmadụ"". Agụba na agịga eji ebecha mbọ ụkwụ bụ otu ụzọ esi ebufe ọrịa Hepatitis. Ijoma kọwara na ọ bu ya mere ka ndi mmadụ ga-enyocha onwe ha. ""Kama mgbe Chronic Hepatitis bidoro, njirimara ya gụnyere anya ịcha odo odo, ụkwụ na afo ọzịza maọbu onye ahụ ebido ịgbọ ọbara"". Ijoma kọwara na mgbe o ruru etu a, onye ahụ no n'ezigbo nsogbu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47457251,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47457251,2019 Elections: Ka ekwe chara ya nkwa '10 million naira' Ogbonnaya Okoro ekwofeela PDP,Ndị be anyị ndị Igbo kwuru na agụụ nwere nchekwube adịghị egbu egbu.,"Ewezuga ya, ọ ka na-atụ ọtụtụ mmadụ n'anya ihe mere Ogbonnaya Okoro onye na-azọ oche gọvanọ Ebonyi steeti na ntuliaka 2019 ga-eji gbahapụ pati ya ga-kwuru pati gọvanọ na-achị ugbua bụ PDP. Ụfọdụ na-ekwu na nkwa ""10 million naira"" nwereike ị bụ mkpalite mmụọ dị na ya bụ omume. Mana lee ihe nkiri a ka ịchọpụta ihe Okoro gwara BBC Igbo kpatara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46252137,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46252137,"Nnamdi Kanu: Liverpool, Iri ji, egwu Phyno na ihe ndị ọzọ na-amasị ya ị maghị","Ọtụtụ ndị mmadụ mara na Nnamdi Kanu bụ onye Isiama Afara, dị na Umuahia, isi obodo Abia Steeti.","Onye mara na Kanu mara agba udi egwu a? Ha makwara na ọ bụ site afọ 2011 ka Nnamdi Kanu malitere dịka onye bụ onyeisi ndị otu chọrọ ịnwere onwe ha nke akpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob). Mana n'ime akụkọ a, ị ga-achọpụta ihe ise ndị ọzọ na-amasị Nnamdi Kanu ọtụtụ mmadụ amaghị maka ya. 1) Ofe Ụgbọgụrụ Nwanne ya bụ Emmanuel Kanu gwara BBC Igbo na ofe a na-atọpụ Kanu isi. O kwuru na: ""Nni olulo na-adị ya mma ebe dị ukwuu. O na-eji ya eri ofe akwụkwọ nke eji ụgụ na ọkọrọ na-esi, nke a na-etinye ụkpaka n'ime ya"" 2) Phyno BBC Igbo chọpụtara na Nnamdi Kanu hụrụ egwu Phyno n'anya nke ukwu. Emmanuel kwuru na egwu ndị ọzọ ha tiri n'oge garaaga wuru ewu dịka egwu Osadebe na Oriental Brothers bụkwa ihe na-amasị Kanu nke ukwu. 3) Liverpool Emmanuel tiri mkpu aṅụrị oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ nke a. O kwuru na: ""Ọ naghị ekwete iri nri ọbụla maọbụrụ na otu Liverpool na-agba asọmpị ọbụla makana egwuregwu bọọlụ bụ ihe na-amasị ya nke uwku"" 4) Nnamdi Kanu na-ekpu mmanwụ Nnanne ya gwara BBC Igbo na Kanu na-ekpu mmanwụ akpọrọ Ekpo ha na-akpọ Eko. N'ọnụ okwu ya: ""N'oge iri ji ọhụrụ, Kanụ na-ekpu mmanwụ akpọrọ Oke Isiekpe."" Ọ gara n'ihu kwuo na Kanu so na ndị wetere Ekpe n'ime obodo ha. 5) Uwe ndị obodo Idoma Kanu na uwe ndị Idoma Emmanuel kọwara na Kanu nwere nkwenye siri ezigbo ike na ya na ndị Idoma bụ otu. O kwukwara na Kanu nwere ọtụtụ akwa ọcha na-amasị ya nke ukwu. Emmanuel kwuru na: ""Kanu were uwe ndị a makana o nwere nkwenye na Igbo niile bụ otu"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48619884,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48619884,George Weah ezutela Buhari n'Abuja,Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah bịara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị Tọọzde n'obi gọọmenti dị n'Abuja.,"Weah bịara zute Buhari Dịka onye nnyemaka na okwu gbasara soshal midia nke onye isiala siri kwụpụta n'igwe Twitter, onyeisiala mba abụọ ahụ nwere mkparịtaụka n'okwu gbasara mmekọịta mba abụọ ahụ dịka o siri gbasa nchekwa na akụnaụba. End of Twitter post, 1 A họpụtala Chiji Collins dịka onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti Ndịomeiwu ọhụrụ na steeti Imo ahoputala Maazi Chiji Collins dịka olu na-ekwuru ha.Nwa amadi a, bụ onye na-anọchite anya okpuruọchịchị Isiala Mbano nke steeti ahụ. A họpụtara ya na-enweghị onye mara ya aka n'ihu.Nke a bụ nke ugboro abụọ ọ na-aga n'ụlọomeiwu ahụ dịka ahọpụtachara ya nke mbụ n'afọ 2015. Uloomeiwu a họpụtakwara Okechukwu Onyekanma, bụ onye na-anọchite anya Mbaitoli nke steeti ahụ dịka osote ya. Onye ọchịehi ebepụla isi nwaagbọghọ n'Ekiti Obodo Ilasa Ekiti dị n'Ekiti Steeti nọ n'ọgbaghara ugbua n'ihi ọnwụ otu nwaagbọghọ onye ọchịehi bepuru isi maka na ọ jụrụ ịlụ ya. Onye ọchịehi a a na-akpọbeghi aha ya chechiri nwaaghọghọ ahụ n'ụzọ ebe ọ gara ịkụte mmiri ma bepu ya isi na Tuzde. Onyeisi obodo ahụ bụ Ajayi Omolagba sị na onye ọchịehi ahụ dị na mbụ kụchie nwaghọghọ site n'aka ezinaụlọ ya dịka iwu ndị Fulani si dị. Mana ndị ezinaụlọ nwagbọghọ ahụ jụrụ ịlụnye ya nwoke ọchịehi ahụ nke mere o ji gbuo nwaagbọghọ ahụ. Ndị uweojii Ekiti Steeti kwuru na nke a mere eme, na ha anwụchiela nwoke ahụ site na kepukepu ha nwetere. Ọkụ gbara ụlọahịa na Port Harcourt Gọmentị River steti etịnyela ọnụ na ya bụ ọkụ mgbara n'ụlọahịa Port Harcourt Shopping Mall. Odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Tammy Danagogo gwara ometutara dere jụụ na ha ga-emezị ya bụ ụlọahịa ka ndị mmadụ malite azụmahịa taa bụ tọzde. Atọọrọ onyeisi obodo na Katsina Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ntọ atọrọla otu onyeeze na Garin Labo dị Kastina steeti. onyeeze ahụ nọ na ugbo ya mgbe ndị ntọ ahụ jị ọgbatumtum bịa ọgụ. N'ofesi Ụnụ anụla nee na onyeisiala mba Mexico bụ Andres Obrador ekwusiela ike na ya ga- ere ụgbọelu onyeisiala were buo agha gbasara ndị obodo ya ịgbafe mba Amerika n'nzuzo. Obrador sị na ya ga na-agbazị ụgbọelu ọha iji hụ na ya mejuputara nkwa ya kwere maka nha mba America chọrọ ịda ndị be ha. N'egwuregwu Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 N'egwuruegwu, Enyimba eburula iko Nigeria Premier league nke ụgbọrọ asatọ ha site n' iji ọkpụ goolo atọ meri Akwa United ụnyaahụ. Enyimba ji akara iri na abụọ n'egwuregwu ise ha gbara, ebe Reuben Bala, Stanley Dimgba na Abdulrahman Bashir nyeere Enyimba goolu. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-56665258,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56665258,Usman Alkali Baba: IGP ọhụrụ na ndị IGP rụọrọla ọrụ n'afọ iri gara aga,Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nọrọ Ụbọchị Tuzde tinye Usman Alkali Baba n'oche Onyeisi ndị uweojii Naijiria.,"Tupu nke a emee, Mohammed Adamu bụ onye Buharị họpụtara n'afọ 2019 bụ onyeisi ndị uweojii. N'ime afọ iri gara aga nke ọchịchị Goodluck Jonathan na Buhari, enweela ndị isi uweojii mmadụ isii ma a gụpụ nke a nọ ugbua. Lee ihe ndị i kwesịrị ịma maka ha: Hafiz Ringim (2010-2012) Hafiz Ringim chịrị ndị uweojii Naijiria n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan. Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa ka ndị Boko Haram kpara ike wuru ewu dịka ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọọrụ UN nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja n'afọ 2011. Ringim pụrụ n'ọkwa ya n'afọ 2021. Ugbua ọ na-arụzi ọrụ ugbo n'Okpuru ọchịchị ya bụ Ringim na Jigawa Steeti n'Ugwu Awusa. Muhammad D Abubakar (2012-2014) Muhammad Abubakar a ma dịka D Abubakar rụrụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii naanị afọ abụọ dịka onye ọ nọchiri. Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa ka ngagharịiwe 'fuel subsidy nke afọ 2012 mere. Ugbua, ọ bụ 'Pro-Chancellor' na onyeisioche mahadum 'Al Hikmah University' dị n' Ilorin, Kwara steeti, ya na oke ọgaranya n'Afrịka bụ Dangote gọrọ ọgọ dịka nwa ya bụ Jamil Abubakar lụrụ nwa Dangote. Sulaiman Abba (2014-2015) Sulaiman Abba bụ otu n'ime ndị bụbu ndị isi ndị uweojii anọghị anọ n'ọkwa ya dịka ọ nọrughị otu afọ. Abba nọchiri Abubakar dịka onyeisi ndị uweojii ma nọkwaa n'ọkwa ahụ rue oge ntuliaka afọ 2015 tupu Jonathan ewepụ ya n'ọkwa. Sulaiman anọọla n'ọkwa dị iche iche n'ọrụ ndị uweojii nke gụnyere onye nche pụrụ iche (ADC) nke nwunye onye bụbu Onyeisiala Sani Abacha bụ Maryam Abacha. Solomon Arase (2015-2016) Solomon Arase bụ onyeisi ndị uweojii gburugburu nke iri na asatọ tupu Jonathan etinye ya n'ọkwa. Ọ bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka nnyocha a kpọrọ ""criminal intelligence and investigations bureau"". Ọ bụ n'oge ya ka e mere ntuliaka afọ 2015 nke webatara ọchịchị ndị APC. Ọ rụkwara na Namibia dịka ndị uweojii na-ekpe udo n'aha otu United Nations ""Namibia peace keeping operations of United Nations"", dịka onyeisi ndị uweojii. Nke a bụ IG dịka onye ọ nọchiri nọrọ n'ọkwa ya naanị otu afọ. Ibrahim Idris (2016-2019) Ibrahim Idris bụ onyeisi ndị uweojii mbụ Onyeisiala Buhari ka ọ banyechara ọkwa onyeisiala. Dịka Wikipedia si kwuo, Ibrahim bụ onyeisi uweojii kwuputara n'ọha ihe ndị o nwere nke mere ka ngalaba 'Code of Conducts Bureau' too ya. Mohammed Adamu (2019-2021) Ihe ndị mmadụ na-eji echeta Mohammed Adamu bụ ngagharịiwe End SARS mere oge ọ nọ n'ọkwa. N'agbanyeghị na o kposara SARS, ọtụtụ kwenyere na ọ gbaghị ọsọ mmiri ahụ n'oge. Onye Nasarawa steeti, gụrụ 'Geography' na mahadum, ọ rụrụ ọrụ afọ abụọ tupu ewepụ ya n'ụbọchị Tuzde. Adamu Mohammed oge ọ gara Owere,Imo steeti Usman Alkali Baba (2021) Alkali Baba bụ onye a kpụ n'ọnụ dịka ọ banyere n'ọkwa onyeisi ndị uweojii ugbua, ugbua. Ọtụtụ ụmụ Naijiria nọ na nchekasị dịka o si gbasa ọnọdụ nchekwa obodo nke na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa n'Ugwu Awụsa. Ọrụ chere Alkali Baba dịka onyeisi Uweojii ọhụrụ Na nso nso a mwakpo na-arị elu n'Ọwụwa-Anyanwụ. Nke kachasị ewu na nso nso a bụ mwakpo a wakporo ụlọmkpọrọ nakwa isiụlọọrụ ndị uweojii n'Owere, isiobodo Imo steeti ebe ndị e ji eji karịrị otu puku riri mbombo ọsọ. N'ọnwa atọ gara aga, ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ anọ n'Ugwu Naijiria. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ, 'Federal College of Forestry Mechanisation' dị na Kaduna ndị ntọ tọọrọ ka nọ n'aka ndị ji ha. N'Ọdịda-Anyanwụ Naijiria, nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ka na-aga n'ihu dịka ọnwụ, na mmebi ihe na-aga n'ihu na mpaghara ahụ." mba-uba-44020803,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44020803,Igbo culture: Anụmanụ asaa ndị Igbo na-asọ na ihe mere ha ji asọ ha,"N'ala Igbo, e nwere ọtụtụ nsọala zụrụ Igbo ọnụ nke na onye meerụọ ya, ọ kpụọ arụ.","Nsọala n'obodo ụfọdụ n'Igbo O meghị etu ahụ, e rie ya nha maọbụ a mapụ ya n'obodo. Nsọ ndị a gụnyere; nwaanyị anaghị awa oji nke o ji arị nkwụ; mmadụ anaghị alụ maọbụ dinaa nwanne ya maọbụ ọbara ya; mmadụ anaghị edina anụmanụ; mmadụ agaghị akwụ ụdọ maọbụ gbuoa onwe ya n'ụzọ abụla ụzọ. Nsọala ndị ọzọ bụ ; nwoke anaghị edina nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị; nwaanyị ibe: nwanne anaghị egbu nwanne ya maọbụ gboo onye ọzọ. I mee ya na-amaghị ama, ị gbaa ọsọ ọchụ. Mana ọ bụghị naanị agwa mmadụ kpasoro mmadụ ibe ya nwere ike ịghọ nsọala n'ala Igbo. Ndị Igbo na-asọ ụfọdụ anụmanụ. E nwere anụ Igbo zuzugbe na-asọ, nwekwaa anụ ndị ọzọ bụ n'obodo n'obodo maọbụ na mpaghara na mpaghara. Ka obodo siri dị icheiche ka ihe ha na-asọ siri dị icheiche. Lee anụmanụ ụfọdụ Igbo na-asọ: 1.Udele N'ala Igbo, anaghị eri udele n'ihi na a na-ewe ya na udele bụ ajọ anụ. Dịka ndị ochie siri kọwaa, nke a bụ n'ihi na udele bụ anụ na-eri ihe nwụrụ anwụ nke gụnyere ozu mmadụ. Akpọmasị a kpọrọ udele n'Igbo mere e ji ahụta ya ka nnukwu abụmaọnụ ịsị mmadụ, ""Udele rie ozu gị."" 2. Nkapị/Nkakwụ Nkakwụ bụ anụ ọzọ Igbo zuzugbe na-asọ. Nkakwụ bụ anụ ya na oke si otu ezianụlọ mana ndịiche bụ o nwere ọnụ ogologo. Ọtụtụ na-asọ nkakwụ nsọ n'ihi ajọ isi ya. 3. Ewi Ndị Igbuụzọ na ndị Nnewi anaghị eri ewi Ndị Igboụzọ (Ibuzọ) dị na Delta steeti na-asọ ewi. N'otu aka ahụ, ndị Nnewi dị n'okpuru ọchichị 'Nnewi-North' na Anambara steeti anaghị eri ewi. Akụkọ mgbe ochie kwuru na iji gbalahụ mwakpo nke ndị iro ' oge gboo, na ndị okenye Nnewi gara kpọta oke dibia bịara gwọrọ ha ọgwụ. Ọgwụ ahụ ghọrọ ewi were gazuo Nnewi niile. Nke a mere ndị iro ha bịazie iwakpo Nnewi, naanị nzọụkwụ ewi ka ha ga na-ahụ, ha echee na onweghị mmadụ bi n'ala ahụ. Onye Nnewi ma ọ nọ n'ụlọ ma ọ nọ na mba rie ewi, ihe na-eso ya. Dịka Christopher Asomugha, onye Nnewi sị kọwaa, onye Nnewi rie ewi, "" ire ya etuo ka ntu"". Ọ gara n'ihu kwuo na o nwere omenala onye ahụ ga-emee, ihe ahụ tụrụ ya n'ọnụ ya niile a laa na-egbughị oge. Ọ bụghị naanị ewi, ndị Nnewi na-asọkwa eke. 4.Ọkwa Ndị Amaigbo dị na Mbaise, Imo steeti na-asọ iri anụ ọkwa. Dịka Udechukwu Agbarakwe, onye AmaIgbo sị kwuo, ọkwa nyere obodo ha aka n'agha ha lụrụ oge gboo nke mere ndị ochie ha ji nye ya ọkwa pụrụ iche. Ndị Nnọkwa n' Anambara steeti anaghị erikwa anụ ọkwa. 5. Enwe Ndị Ọka anaghị eri enwe Ndị Ọka (Awka) na ndị Ojoto n'Anambara steeti anaghị eri enwe. Ndị ọzọ na-asọ enwe bụ ndị Orodo nakwa ndị Lagwa na Mbaise n'Imo steeti. Otu onye Orodo bụ Obinna Akunna gwara BBC na ihe ndị obodo ha ji asọ enwe bụ n'ihi na"" o yiri mmadụ"". Ndị Agbọ(Agbor) dị na Delta steeti na-asọ enwe. Ha na-egbu ya mana ha anaghị eri ya. Nnabuihe gara n'ihu sị, ""N'obodo Agbọ, ha na asọ enwe. Ihe kpatara ha ji asọ enwe bụ na otu n'ime ndị eze chịrị ha bụ dinta. ""mgbe ọ na-achụ nta,ụmụanụ dogburu ya n'ọhịa. Ha kwenyere na ọ bụ ụwụ anụ nọ n'ezinaụlọ enwe. Ya kpatara ha anaghị eri enwe. ""Ebe ọbụla ha hụrụ enwe ha na-egbu ya, mana ha agaghị eri ya."" 6. Eke Onye ọbụla gburu eke n'obodo a na-asọ ya na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ Ọtụtụ obodo dị n'Anambara steeti, ọkachasị ndị dị n'okpuru ọchịchi Idemili-North dịka Uke,Neni, Umuoji, Abba,Abatete, Nnobi, Awka-Etiti, wdg...na-asọ eke. Ha anaghị egbu ya maọbụ rie anụ ya nke a bụ n'ihi na eke bụ ihe e ji mara 'Idemili bụ chi ọtụtụ ndị Igbo si mpaghara ahụ na-efe oge ochie. Mana ọ bụghị naanị ndị Anambara na-asọ eke, akụkụ ebe ụfọdụ n'Imo steeti na-asọkwa iri anụ eke. Ọkammụta na mmụta maka Afrịka na asụsụ na mahadum 'University of Lagos' bụ Chigozie Nnabuihe si kọwaa, ndị Imo ndị mmiri Njaba gafere obodo ha na-efe mmiri ahụ nke e jikwa eke mara. Dịka Anachuna Phillano, onye Abba dị n'okpuru ọchịchị Njikọka Anambara steeti siri kwuo, onye gburu eke na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ. Ihe ịtụnanya dị n'obodo ndị a na-asọ eke bụ na eke anaghị ata ha maọbụ chọọ ha okwu. Mana ọ bụghị ndị Igbo niile na-asọ Eke; ụfọdụ ndị Igbo si Ebonyi na Enugwu steeti na-ahụ eke dịka nnukwu anụ ntanta. 7. Mbe Ndị Awo-Idemili anaghị eri mbe, ebe e nwere mba na-ahụ anụ mbe dịka nnukwu ihe oriri Ndị Awo-Idemili dị n'Imo steeti anaghị eri anụ mbe. Ha na-asọkwa iri anụ eke. Gịnị mere e ji asọ ụfọdụ anụmanụ? Dịka ndị okenye siri kọwaa, nke a bụ n'ihi ụfọdụ n'ahụta anụ ndịa dịka chi ha na-efe n'oge gboo. Ọtụtụ na-asọkwa anụ ụfọdụ na-amaghị ihe mere ha ji aso ya karịa kwa na ""ndị be anyị na-asọ ya."" Na nkọwa ya, Nnabuihe kwuru na obodo ọbụla nwere ihe kpatara ha ji asọ ihe ha na-asọ. ""O nwere akụkọ so ihe ọbụla obodo ọbụla na-asọ."" Gee nkọwa Nnabuihe n'uju ebe a: Ihe kpatara obodo ji asọ ihe ha na-asọ - Ọkammụta N'otu aka ahụ, otu onye omenala doro anya bụ Ezenka Agbarakwe kọwakwara, ihe mere ọtụtụ obodo n'ala Igbo ji asọ anụmanụ dị iche iche bụ ""maka ihe anụ ndị ahụ mere ha."" Dịka Nnabuihe na Agbarakwe siri kọwaa, nsọ anụmanụ ụfọdụ ndị metụtara mmalite obodo ndị ahụ, agha maọbụ ọdachi dagidere ha nke anụ ahụ ha na-asọ nyere ha aka gbabido. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49392538,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49392538,Nnamdi Kanu: Gwa anyị ebe ndị Gọvanọ gị nọ ma ị chọọ N1m,"Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ọ ga-enye onye ọbụla nwetara ozi bara uru gbasara etu aka ya ga-esi kpata ndị ndu ndị Igbo ma ha bịa mba ofesi, otu nde naịra.","A hụbeghikwa nne na nna Nnamdi Kanu kemgbe Septemba 2017 ndị agha Naịjirịa mere 'Operation Python Dance' n'ụlọ ha. O kwuru na ụjọ anaghị atụ ha bụ ndị IPOB ịga ụlọmkpọrọ ma ọ bụrụ ihe ọ ga-eweta. Nke a pụtara ihe dịka ọ gbasara ozi na mgbede ụbọchị Sunde ebe ọ tinyere ọnụ n'okwu metụtara ihe etiri Ekweremadu na mba Jamini. N'akụkọ yiri ya, Sinetọ Enyinnaya Abaribe, gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa, na ndị isi a hụrụ kwaba okpu ndị ọzọ na Naịjirịa akatọọla ihe e tiri Sinetọ Ike Ekweremadu na mba Jamini ụbọchị abụọ gara aga. Abaribe kwuru na ọ bụ igosi enweghi obi ekele maka nwoke bu ihe gbasara ịzọtara Igbo ihe ọma ruru ha n'isi, ebe Okowa kwuru ka ndị Naịjirịa nọ ebe ọbụla n'ụwa kwanyere onwe ha ugwu ghara ime ihe ga-emechu mba a aha. N'ofesi, Ndị uweojii sị na James Reardon dị naanị afọ 20 nwere okwukwe na ọ bụghị mmadụ niile kwesịrị ịnọ na mba ya Aka akparala James Reardon bụ nwaamadi ndị uweojii obodo Ohio dị na mba Amerịka na-enyocha maka inwe ebumnobi ịgbagbu ndị mmadụ n'otu ụlọekpere ndị Jew. Ndị uweojii chọtara ọtụtụ ngwaagha ka ha gara tụọ imi n'ala nyochaa ụlọ ya. N'egwuregwu, Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela otu bọọlụ nkata ụmụnwaanyị Naịjirịa e ji Dtigress mara, ka ha mabutere Iko Mba Afrịka nke ugboro anọ ha. Dtigress butekwara iko a n'afọ gara aga, meriri mba Sịnịgal, ebe nwaafọ Igbo bụ Ezinne Kalu, nwetara ntuurugo ""ọkacha baa uru"" n'asọmpi ahụ. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lere ihe nkiri ga-amasị gị: Food vendor: Ndị mba ọzọ na-abọ nri ma abọ karịa ndi Naịjirịa" egwuregwu-43276120,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43276120,Davide Astori onyendu Fiorentina anwụọla n'afọ 31,Onyendu otu egwururegwu bọọlụ Fiorentina n'akwa Italy bụ Davide Astori anwụọla n'afọ 31.,"Astori agbala Fiorentina bọọlụ ugbolo 27 na 'season' a Astori na-agba ka onye nchekwa nwụrụ ka arụ rịara ya, ndị Fiorentina kwuru na Twitter. End of Twitter post, 1 Fiorentina kwesiri ịgbasị ndị Udinese bọọlụ na 'Serie A' taa mana akagbuola asọmpị ahụ. Astori gbaara ndị Italy bọọlụ ugboro 14. Ọ si Cagliari gawa Fiorentina n'afọ 2016 ebe ọ gbaara ha bọọlụ ugboro 58. N'otu aka ahụ, Cagliari na onwe ha kagburu asọmpi ha na Genoa kwesiri ịgba taa . ""Fiorentina na ada ezigbote iriuju maka ọnwụ onyendu anyị bụ Davide Astori,"" Fiorentina kwuru. ""Maka ọdachị a na etu o siri di, anyị na arịọ ka mmadụ niile kwanyere ndị nwe ya ugwu."" Astori bidoro njem bọọlụ ya na ụlọ mmụta nke ụmụaka n'AC Milan tupu ọ gawa Cagliari na 2008. Ọ nọ afọ asaatọ na Cagliari, bụ ebe ọ sikwa ga gbaara ndị ọzọ bọọlụ n'ụdị ndị Bekee na-akpọ 'loan'. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-56962308,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56962308,27 Years Bill and Melinda Gates Marriage: Ha agbaala alụkwaghịm ka afọ 27 gachara,Bill na Melinda Gates agbaala alụkwaghịm ka ha lụchara di na nwunye ruo afọ iri abụọ na asaa.,"""Anyị agaghị etolizi dịka di na nwunye,"" "" Anyị echela nakwa ezigbo ọrụ anyị tinyereala na mmekọrịta anyị, anyị e kpebiela ka anyị ka anyị gbasaa dịka di na nwunye,"" dịka ha si depụta na twitter. End of Twitter post, 1 Ha bụ ụzọ hụ onwe ha n'afọ 1980 mgbe Melinda batara n'ụlọ Microsoft nke Bill. Ha abụọ nwere ụmụ atọ ma na-ahazịkọta ngalaba Bill & Melinda Gates Foundation ọnụ. Ngalaba ahụ etinyela ego ijeri kwuru ijeri n'ibuso ọrịa na-efe efe ma na-arịọ ka agba ụmụaka ọgwụ mgbochi. Ndị bee Gate na onye azụmahịa akpọrọ Warren Buffet so na ndị hibere "" Giving Plegde"" na-akpọkụ ndị nwere ọtụtụ ego ka ha jiri akụ na ụba ha mepụta ihe ọma. Gates kpatara ego ya mgbe ya na onye ọzọ chopụtakọrọ ụlọọrụ Microsoft n'afọ 1970. Etu ịhụnanya ha si malite Melinda dị afọ iri ise na isii malitere ọrụ na Microsoft dịka onyeisi ngwa ahịa n'afọ 1987. Ha abụọ mechara nọọkọọ otu tebulu n'otu emume ndị azụmahịa mere na New York n'afọ ahụ. Etu ahụ ka ọyị ha si malite mana Bill gwara otu ụlọọrụ akpọrọ 'Netflix documentary' na ha abụọ hụrụ onwe n'anya nke ukwuunke bụ na naanị otu n'ime ihe abụọ nwereike ime. Nke mbụ bụ na ha nwerike itasa maọbụ lụọ onwe ha. Ha mehara lụọ onwe ha n'afọ 1994. Bill dị afọ iri isii na ise mechara rituo dịka onyeisi Microsoft ka o wee gbadoo anya n'ihe ndị gbasara inyere ndị mmadụ aka. Gịnị bụ Gates Foundation? Di na nwunye a hibere ngalaba Bill na Melinda Gates Foundation n'afọ 2000 na Seattle. Ngalaba ahụ gbadoro anya na ahụike, agụmakwụkwọ nakwa ihe gbasara mgbanwe ihu igwe. Ha wepụtara ego ruru dọla otu Ijeri maka atụmaatụ ọgwụ mgbochị ọbụla nakwa nyocha maka covid 19. Bill na Melinda Gates wụnyere ego ruru $36bn na ngalaba Bill na Melinda Gates Foundation site n'etiti 1994 na 2018" afirika-43770026,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43770026,Man City nọ n'ụlọ buru iko Premia Lig,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Man City tukwu n ' ụlọ merie Premia Lig,"Man City na Arsenal hazi n'iko Premia Ligi Newcastle meriri Arsenal n'asọmpi ya taa Newcastle emiela n'asọmpi atọ ha gbara n'otu ahịrị N'egwuregwu, Newcastle ji ọkpụ goolu abuo asatara otu (2-1) wee merie Arsenal n'asompi a gbara taa. Arsenal bu uzo nye goolu tupu Newcastle asaa ya, were nyekwa nke ha jiri nweta mmeri na ya bụ asọmpi. Ndị agha oshimiri mba Ghana jidere ụgbọmmiri mmanụ agbịdị ndị Naịjirịa Ọchịagha ụgbọmmiri mba Ghana bụ Commodore Issah Yakubu sị na ụgbọmmịri Naịjirịa ejighị akwụkwọ ikike Ndị agha oshimiri mba Ghana akparala ụgbọmmiri ahịaiwu mmanụ agbịdị ndị Naịjiria. Ụgbọmiri ahụ bu mmadụ iri na otu (11) ma burukwa mmanụ ruru metrik tọn narị atọ na iri abụọ (320). Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị Edo Steeti anwụchiela ndị ọchịehi Obaseki nwụchiri ndị ọchụehi na Odighi na Odiguetue dị n'Edo steeti Aka na-achị steeti Edo bụ Godwin Obaseki, anwụchiela ndị ọchịehị n'obodo abuo na steeti ahụ. Obaseki hibere komitii gbata gbata ga-enyopu ebe ndị ochịehi n'ime ọhia ma kpụgara ha ndị uweojii. Na mba ofesi Nikki Helay na anọchite anya US na UN Onye nnọchite anya US n'ọgbakọ otu mba uwa bụ UN bụ Nikki Haley, ekwuola na mba ha agaghị esi na Syria pụta ma ebum n'obi ha emezughị. Ime ka Syria kwụsi iji ngwọagha kemikal gbuo ndị be ha so n'ihe Nikki Haley kwuru bụ ebumnobi ndị US. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ụmụ Igbo na-agba mbọ na Ladipo, Legos. Gear technican advises Igbo to pay attention to handwork." 50149661,https://www.bbc.com/igbo/50149661,Xenophic attack: 'Ọnweghị ezigbo ihe mere e ji wakpọ ndị be anyị ọzọ na Saụt Afrịka' - Onowu na Saụt,Na mwakpo ọhụrụ e nwere na Witbank na Mpumalanga Province dị na Saụt Afrịka akụkọ na-eru anyị ntị bụ na e meruru mmadụ anọ ndị Naịjirịa ahụ ma gbakwa ụfọdụ ụlọ ha ọkụ.,"Ụlọahịa agbara ọkụ na Saụt Afrịka Onowu ndị Igbo na Saụt Afrịka bụ Ezeali Udeji Jonas gwara BBC Igbo na ya na onyeọrụ Naịjirịa akwụkwọ ikike njem dị n'aka gara ebe ya bụ ihe mere were anya ha hu. Ezeali sị na ha hụrụ ụlọ ndị mmadụ ndị omekome ahụ gbara ọkụ ya na ụlọahịa nwafọ Igbo Obinna Nwanaji so n'ihe ya bụ ọkụ gbara. Ọ sị na ozi ya nwetere tupu ha agawa njem nlete ahụ bụ na ndị isi ọkwọụgbọala na Province ahụ malitere ịgba ụlọ ndị mmadụ ọkụ n'ụtụtụ ahụ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ""a gbara ụlọ ise ọkụ, atọ n'ime ha bụ nke ndị Naịjirịa' ma merụọ ndị Naịjirịa anọ ahụ, dịka Ezeani si kwuo. O kwukwara na ""ha zukwara ngwaahịa ndị be anyị ọkụ tupu ha agba nke fọrọ ọkụ"". Ọ sịkwa na ha gara ụlọọrụ ndị uweojii ije jụọ ha ebe ya bụ mmiri sị baa opi ụgbọghịrị. N'olu ya, ụsa ha nyere ha bụkwa otu ihe ha kọọrọ ha n'afọ gara aga mgbe ụdị ihe a meburu. BBC ka agbalịri ịnwete ndị uweojii Saụt Afrịka ka ha zara ọnụ ha mana ha ebughị ekwenti ha. Lee ihe nkiri a Mama Jessie Onuigwe: Mama dị afọ 104 ji ọrụ ugbo zụọ ụmụ ya Akụkọ ka amasị gị" media-44369159,https://www.bbc.com/igbo/media-44369159,Abakaliki Fire: Ụgbọala asatọ na ụlọọrụ anọ gbara ọkụ n'ọdọ,Ọkụ gbara ọdọ ndị ọrụaka ụgbọala n'Abakaliki ụnyaahụ.,"Ọkụ gbara ọdọ ndị Mekanik Abakaliki Otu onye na-arụ ọrụaka mekanik na ya bụ ọdọ aha ya bụ Sylverster Okemmiri kwara BBC ihe a n'ụtụtụ a. Dịke o kwuru, ""ọkụ a nke gbara n'isi ụtụtụ ụnyahụ gbara ihe dịka ụlọọrụ anọ na ihe ruru ụgbọala asatọ gwogwo "". Cruz Nwachi bụkwa otu n'ime ndị na-arụ ebe ahụ sịrị na na-ezie ha enwere ọgbaaghara gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime ha mana odoghị ya anya ma ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba a. Nwachị sị na ndọrọndọrọ a, nke ọ si na ọ bụ ndị gọọmenti bụtere site na-itinye onyeisi nke ndị otu ha anabataghị, bụ ihe butere ọgbaagha n'ime ha. Mana ha amaghị ka ọnwere ka o si gbasa ọkụ a gbara. Ka ọ dị ụgbụa ndị otu ahụ nọ n'ọgbakọ itinye ọnụ n'ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba. Akụkọ kachasị taa: Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọgbụnigwe egbuola ndị uweojii na kwa Russia 2018 fọrọ abali asatọ" afirika-49808579,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49808579,Omoyele Sowore: Ụlọikpe sị ka a tọhapụ ya,Ụlọikpe n'Abuja sị ka atọhapụ Omoyele Sowore bụ onye nwe ulọọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters.,"Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Na mkpebi o mere n'Abuja taa, ụlọikpe sị na gọọmentị wepụrụ akwụkwọ ha tinyere iji rịọ ka adọọtịe ọnọdụ Sowore n'aka ha. Nke mere na ha enweghi ikike ijide ya gafee ụbọchị 45 iwu nyere. Agbanyeghị na ụlọikpe si ka Sowore lawa, o kwukwara na o ga-ahanye akwụkwọ o ji eme ọpụpụ na mbata bu nke Bekee kpọrọ ""passport"" n'aka gọọment. Ọ sịkwa na Ọkaiwu ya bụ Femi Falana ga-akpọtarịri ya mgbe ọbula ụlọikpe chọro ya. Ụlọikpe mba Briten agbaghala Boris okwu Ụlọikpe ukwu na mba Briten akagbuola atụmatụ Boris Johnson imechinata ụlọomeiwu mba ahụ nwamgbe nta maka na ọ dịghị n'iwu. Johnson mechinatara ụlọomeiwu mba Briten izuụka ise ka Eze nwaanyị mba bụ Queen Elizabeth nwee ike kwado agụmaagụ ya maka ihe ọ chọro ime n'ọdị n'ihu. Mana ụlọikpe jụru kwiki na ya bụ amụma adịghị na iwu, ịkwụsị ndị omeiwu ọrụ ha. Ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Lady Hale sị na "" ajọ ihe ọ ga-ebutere obodo ahụ karịrị akarị"". Ndị ọrụ egwujiela mbazụ n'Abịa Poly Ndi uweojii nọchiri ụzọ n'Abia Poly Abia steeti Polytechnic Aba ewunrula ọkụ ọzọ ebe ndị ọrụ na-etimkpu na akwụbeghị ha ụgwọ ọnwa kemgbe ọnwa iri na isii. Nke ka njọ bụ na ndị isiọrụ sị na ha nwa anwa gba abụbụ ọrụ, achụọ ha n'ọrụ, dịka onyeisi otu ndị ọrụ bụ Nwachukwu Chukwu si kwa BBC Igbo. Otu ndị ọrụ a boro onyeisi ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Eboh Eboh ọtụtụ ebubo nke gụnyere ịkụpịa ego ya bụ ụlọakwụkwọ n'ụzọ na-akwụghị ọtọ. Ha bokwara Eboh na o riri ego isusu ndị ọrụ nke ruru nde narị Naịra abụọ am birikwa n'ụlọ oriri na nkwari kemgbe 2017 akpọrọ ya na ya bụ ọrụ. BBC kpọkwara Mazi Eboh ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo ndị a mana ọ zaghị ekwentị ya. Nchekwa adịghị n'Abuja Ndị ọkachamara na ọrụ nchekwa agwala onyeisi ndị uwe ojii bụ Mohammed Adamu ka o wepụ aka n'ụbọ na ụbọ ga-ebutere ya ọrịa. Ndị otu a ekweghị n'ihe Adamu kwuru na nchekwa dị n'Abuja dịka o si tuo n'ọnụ. Ndị otu a gụpụtachara ihe ọjọọ niile mere n'Abuja nso nso a dika ntọ, ohi na arụ ndị ọzọ dịka ihe gosiri na nchekwa adịghị n'Abuja dịka Adamu turu n'ọnụ. Mba UK, France na Germany eisiela ọnwụ na Iran nyụrụ ihe na-esi N'ofesi, Iran etiela mkpu, gọọ maka ebubo mba Germany, France na UK na-ebo ha maka ịtu ogbunigwe na ebe a na-emepụta mmanụ agbidi na Saụdi Arabia. Agbanyeghị na ndị ọchọngaloko Houthi ejirila ya bụ arụrụala nyaa isi, mba ndị a ka na-ekwusi ike na ọ bụ Iran tụrụ ya. A ga-amachi Rushịa n'egwuregwu mbaụwa? Enwere ike ịmachi mba Russia n'egwuregwu mbaụwa ma ọ bụrụ na ha akọwataghị muchi muchi dị n'akwụkwọ nkọwa ha degara ndị World Anti Doping Agency. Ndị otu a nyere Russia izu atọ iji kọwa nkagbu enwere na ya bụ akwụkwọ nkọwa maka ebubo ịkpacha anya nye ndị nnọchite anya ha ọgwụike. Gee akụkọ ndị a na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri ebe a Ihe mere m ejighi nwee TV na be m - Cosmas Maduka Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49212866,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49212866,Cult clash: Ọgụ ndị otu nzuzo ataala isi ụmụokorobịa atọ n'Anambra,Ndị uweojii n'Anambra steeti ekwuola na ụmụokorobịa atọ a gbagburu n'Ogidi nakwa Ogbunike bụ maka ihe gbasara otu nzuzo.,"Ndị uweojii Naijiria Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti kwuru nke a mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ. Ụkwụ tọrọ ndị mmadụ n'ala taa bụ Fraide mgbe ndị ekperima gbaara ụmụokorobịa abụọ tọgbọ n'ahịa Oye Ogidi . Ndị nọ nso mgbe ya bụ ihe mere kwuru na aha ụmụokorobịa ndị ahụ e gburu bụ Chisom Umeadị, onye Anietiti Ogidi, nakwa Ebuka. Mohammed gwara anyị na ya bụ ihe mere n'eziokwu. O kwuru sị, ""a na-enyo ụmụokorobịa ndị ahụ enyo na ha so n'otu nzuzo 'viking' mana anyị amatabeghi ndị gburu ha. ""Anyị na-agbazị mbọ ugbua ịchọpụta ndị kpara arụ a."" Mohammed kwuru na ndị ahụ gbagburu nwokorobia ọzọ aha ya bụkwa Ebuka n'Ogbunike. Ọ gwara anyị na ụmụokorobịa ahụ akarịghị afọ iri abụọ na ise ruo afọ iri abụọ na asaa. Mgbe anyị jụrụ ya ihe ndị uweojii na-eme iji belata ihe gbasara otu nzuzo n'Anambra, Mohammed kwuru na ha na-anwa oke ha. Ọ sịrị, ""Anyị na-anwụchị ndị otu nzuzo kwa ụbọchị. ""N'izuụka gara aga, anyị nwụchịrị ndị ntorobịa ruru iri anọ na anọ bụ ndị a na-arụ aka iso n'otu nzuzo."" Haruna kwukwara na onyeisi ndị uweojii na Naijiria bụ Adamu Mohammed nakwa onyeisi ha n'Anambra steeti enyela iwu ka ha gbaa mbọ kwụsị ihe ọbụla nwere ike ibute nkwafu ọbara na mpaghara Naijiria niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Otu nzuzo napụrụ m akwụkwọ m tara ahụhụ wee banye'" afirika-55695813,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55695813,Aguleri na Umuleri: Ihe mere n'etiti obodo abụọ a ụnyaahụ,"Ndị uweojii nọ n'Anambara steeti ekwuola na ọ bụ esemokwu okeala butere okwu dapụtara n'etiti obodo Umuleri na Aguleri dị n'okpuruọchịchị Anambra Ist ụnyaahụ bụ Jenụwarị 16, 2021.","Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na nke a mere ka onyeisi ndị uweojii zipu ndị otu ya ka ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jịkọọ aka gaa meyụọ nsogbu ahụ dapụtara ebe ahụ. O kwuru na ebe niile adaala jụụ, ebe ndị ọrụ ha ka na-agagharị n'ogbe ahụ iweta udo ebe ahụ. O kwuru na o nweghị onye tufuru ndụ ya maọbụ merụọ ahụ n'ọgbaghara ahụ, mana ụfọdụ ndị si obodo abụọ a na-alụ ọgụ gbara ụgbọala anọ na ọgbatumtum abụọ ọkụ. Haruna kwuru na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ CP John B.Abang enyela iwu ka ụlọọrụ nnyocha ndị uweojii dị n'Awka ka nyochaa ma mata ihe niile gbasara ọgbaghara a dapụtara ọhụrụ n'etiti Aguleri na Umuleri iji mara ndị dara iwu ikpe. “Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila(Benue) na Ngbo(Ebonyi) bụ itinye oke-ala”...Chairman Ohaukwu LGA Kọmishọna Abang rịọkwara ka ndị obodo a mịaghachị mma ha n'ọbọ ma were ụzọ iwu kwadoro wee chọọ udo. O kwuru na ọ ga-akpọtụrụ gọọmentị Anambara steeti ka o weta ogbugbo tọrọ atọ maka nsogbu. Kọmịshọna na-ahụ maka mwulite obodo n'Anambara steeti bụ Marcel Ifejiofor bụkwa onye Aguleri, kwuru na ihe a kọọrọ ya butere ya bụ mkpamkpa bụ na otu onye Umuleri onye Umuleri ji ụgwọ nwụrụ mgbe ọ gara ịnata ụgwọ n'aka onye otu ya. Ndị otu onye ahụ gburu mmadụ gara n'akụkụ Aguleri mebisiwe ụlọ ka ọ wee dịka ka ọ bụ obodo na obodo na-alụ ọgụ. Ifejiofor kwuru na ọ bụ eziokwu na a na-enwebu esemokwu ala n'etiti obodo abụọ a, mana ndị igwe na gọvanọ Anambara steeti amanyela ọnụ n'okwu ahụ na-ele anya iweta udo gbasara esemokwu okeala. Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde bụ Jenụwarị 16, 2021 ka gọọmentị Anambara steeti tinyere mmachị ngagharị n'obodo Aguleri, Umuleri nakwa Umuoba Nnam maka ọgbaghara a dapụtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46057217,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46057217,Sex doll: Ihe mere ụfọdụ ụmụnwoke ji 'alụ' nwabebi,"Ọ bughi ịhe ọhụrụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-ejizi nwabebi eme enyi, kama ihe mgbawoju anya bụ etu ha si azụta ya n'agbanyeghi na ọ dara ọnụ.","A na-ere nwa bebi na mba ofesi Nwoke akpọrọ ""Pretty Mike of Lagos"" zụtara nwa bebi dịka onyinye o nyere onwe ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. Kamgbe o wepụtachara foto gosiri ebe ya na nwabebi nọ, ndị mmadụ nọ soshal midia etinyela ọnụ n'okwu ahụ. Cheta na n'ọnwa Mee nke afọ a, otu otiegwu akpọrọ Shuga Shaa bụ onye Delta steeti kwuru na ọ zụtara nwabebi ya n'ọnụ otu nde naira (N1,000,000). Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị Ọ zutaara ya ụgboala ma kpọrọ ya na-aga ụlọ ihe nkiri. Etu o si kwụrụ ugbua, ""Pretty Mike of Lagos"" depụtara n'elu soshal midia na ""ndị mmadụ na-ahụ nwabebi dịka nke e ji enwe mmekọrịta mana mụ onwe m na-ahụ ya dịka onye nkasiobi, onye na-anọkete m nakwa onye na-agaghị agbaghapụ m."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46357100,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46357100,Divorce: Etu e si eme ya n'ala Igbo,"Di na nwunye ịkwasa alụmdinanwunye ha anaghịzị ara ahụ n'ụwa ugbua, mana ọ bụ ihe na-eme n'ala Igbo?","N'ala Igbo, di na nwunye anaghị anọkata teta n'ụra sị na ha anaghị alụzị, maọbụ nwaanyị alụziri ọfụma akwara akpa ya pụọ n'ụlọ di ya na-echeghị ya eche ọfụma. E nwere usoro a ga-eme n'omenaala tupu nwaanyị esi n'ụlọ di ya pụọ, makana Igbo kwenyere na onye lụrụ di ga-alụ ya ruo mgbe ebighiebi. Ịgba alụkwaghịm Alụkwaghịm n'ala Igbo pụtara na di na nwunye ahụ ekwenyela na enweghịzị ihe ga-ejikọ ha na ezinaụlọ ha karịa ụmụ ha. Mgbe gboo, ịgba alụkwaghịm rara ezigbo ahụ, nke bụ na ezinaụlọ nwoke chọrọ ịchụpụ nwunye ya, ga-ebu ụzọ nwee ọgbakọ ebe ọ ga-akọwa ihe mere o ji chọọ ịkpọla ya. Ha ga-ekpe ikpe dị na ya, tulee uche ịmata ma ihe o kwuru ozuru iji chụpụ nwaanyị na di. Usoro alụkwaghịm Ezinaụlọ abụọ ahụ (nke nwaanyị na nke nwoke) ga-agbakọta, tulee ọnọdụ ahụ ọzọ, jụọ ajụjụ ma gere ihe ha nwere ikwu, taa ha ụta, dụọ ha ọdụ, tupu ha ekpebie ma alụmdinanwunye ha a ga-ebi ka ọ gaghị ebi. Ha kpebie, ezinaụlọ abụọ ahụ ga-agbakọta n'ụlọ nna nke nwaanyị dịka ọ dị oge ha gbara nkwụ; ezinaụlọ nke nwaannyị ga-akwa ezinaụlọ nke nwoke ọbịa (nye ha ọjị, mmanya na nri). Ụfọdụ na-eme emume ahụ ka ọ dị ka ụbọchị di na nwunye ahụ gbara nkwụ. Na ngwụcha, nna nwunye ya ga-enyeghachị ya ego ole e ji kwụọ ụgwọisi nwa ya. Bido mgbe ahụ gawa n'ihu, alụmdinanwunye ha akwụsịla. Ihe nwereike ibute ịgba alụkwaghịm n'ala Igbo 1) Amụtaghị nwa: Ndị Igbo anaghị eji nwa egwu egwu, ọkachasị nwa nwoke. Ọ bụrụ na di na nwunye amụtaghị nwa, ọtụtụ oge ọ na-ebute alụkwaghịm, makana ezinaụlọ nwoke ga-ebido inye ya nsogbu gaa kpọta nwaanyị ga-amụtara ya nwa. 2) Ịgba n'ezi ọkachasị ma ọ bụrụ nwaanyị: Ndị Igbo kwenyere na ịgba n'ezi bụ njọ nye ma Chukwu, ọha, ezinaụlọ onye nakwa di maọbụ nwunye onye gbara n'ezi. N'ụfọdụ obodo, nwunye mmadụ gbaa n'ezi, di ya anwụọ maọbụ ihe ọjọọ emee. Nke a mere ụfọdụ na-eji ahapụ ka a gbaa alụkwaghịm ma otu onye gbaa n'ezi; ka ihe ọjọọ ghara ime. 3) Enweghị ike ịlekọta ezinaụlọ: Nwoke na-enweghị ikike ịlekọta ezinaụlọ ya, nke a bụ mbido nsogbu ya. Makana ọtụtụ oge, ọ na-ebute mkparị nke na-ebute esemokwu na-ebutekwa alụkwaghịm. 4) Mmegbu: Nwoke na-emegbu nwunye ya maọbụ nke na-eti nwunye ya ihe, nwereike ịhụ na ọ ga-achọ ịgba ya alụkwaghịm. Nwunye ya nwere ike gakwuru nna ya gwa ya na ọ chọghịzị ịlụ di ya. Ụdịrị nke a mee, nna ya nwere ike kpọkuo ndị ọgọ ya, nyeghachị ha ụgwọisi ha kwụrụ, ma kpọrọ nwa ha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45179632,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45179632,Ndị ụka Ekwensu na-ewere Naịjirịa iwe,"Ndụ ụka ekwensu nke kpọrọ onwe ha ""Church of Satan"" na Bekee akpọpụtala Naịjirịa maka na ndị ndu Naịjirịa na-akpọ aha onyeisi ha etu masịrị ha.","Onye kpasuru ha iwe ọhụrụ a bụ onye bụbụ mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ụgbọelu bụ Femi Fani-Kayode, ebe o kwuru na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibanjo bụ 'Onyeozi Ekwensu."" Fani-Kayode dere n'akara twitter ya na osote onyeisiala Osibanjo enweghi ikike ikatọ ndị ụkọchukwu na-anaghị ekwu okwu megide mpụ na ha na-emejo ụka Kraịstị. Ọ gara n'ihu kwuo na Osibanjo n'onwe ya rapụtakwara ndị ụka Kraịstị maka na ọ bụ onye ụkọchukwu. Fani-Kayode nọ na-azaghachi Osibanjo bụ onye na-akatọ ndị ụkọchụkwụ Naịjirịa na ha anaghị akwado gọọmenti Buhari n'agha ọ na-ebuso mpụ. Mana ọ bụ ihe Fani-Kayode kwuru mere ndị ụka Ekwensu jiri wee iwe. Ndị ụka ahụ azaghachibuola onyeisiala Muhammadu Buhari n'ozi o dere n'akara twitter ebe o kwuru na ndị na-awakpo ụlọụka bụ ndị ajọ ọrụ ekwensu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48102709,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48102709,Life Expectancy: Gịnị mere ọtụtụ ndị Naịjirịa ji anwụ ọnwụ erughi eru?,"N'akwụkwọ ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2019, nke United Nation wepụtara kwuru na obibi ndụ ndị Naịjirịa ugbua akpọrọ Life Expectancy na bekee nọ zi na afọ iri ise na ise.","Naịjirịa bụ ndị atọ kachasị ala n'ụwa, nke mere ha ji kara naanị mba Sierra Leone, Chad na Central African Republic. Ajụjụ a bụrụ ""Gịnị mere ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị ebi ogologo ndụ dịka o kwesiri?"" Mana onye dọkịnta na ngalaba ahụike na ebe obibi aha ya bụ U. David Udo-Umo kọwara BBC Igbo ụfọdụ ihe mere ndị Naịjirịa ji anwụ ọnwụ n'erughi eru. O kwuru na ihe na akpata ọnwụ erughi eru na Naịjirịa bụ ụdị ndụ ndị mmadụ na-ebi, nke gụnyere: Oke nchegbu na ndọga Dọkịnta David Udo-Umo kwuru na nchegbu na ndọga na-arị ibe ya elu na Naịjirịa ugbua nke si n'akụkụ ọrụ, ezinaụlọ, enweghi ego ga-ezuru mmadụ igbo mkpa dịrị ya. O kwuru na nchegbu na ndọga ndị a nwereike ibute ọbara mgbali elu bụ nke nwereike ibute ọnwụ erughi eru. Udịrị nri ndịmmadụ na-eri Nrị ọnụụtọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-erizi ugbua karịsịa ụmụnwaanyị Dọkịnta David gara n'ihu kọwaa na ụfọdụ nrị ndị mmadụ na-eri so na ihe na-ebute ọnwụ erughi eru na Najirịa. O kwuru na ụfọdụ nri ndị a gụnyere nnu na-esighi n'ọkụ, nri ndị eghere eghe nakwa ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya na-ebute oke ọbara mgbali elu. David kwuru na ndị mmadụ kwesiri ị na-eri ezigbo nri nwere akụrụngwa niile ahụ mmadụ chọrọ. Enweghi nlekọta ahụike Dọkịnta kwuru na ọtụtụ ndị Naịjrịa anaghị a ga ụlọọgwụ ime nyocha banyere ahụike ha dịka ọbara mgbalị, imeju ahụ, mmiri dị n'ahụ, akụrụ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ. O kwuru na ndị mmadụ kwesiri ị ma ọnụ ọgụgụ ahụike ha n'oge niile na nke nyere ha aka ị nọ n'ahụike mgbe ọbụla. Enweghi ezigbo mgbatị ahụ na ezumike Onye dọkịnta kwuru na ndị mmadụ anaghị ewepụta oge mee mgbatị ahụ bụ 'exercise' na bekee ma ọ bụ kwanụ zuo ezigbote ike. Na nke a so na ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji ada ma nwụọ n'ike n'oge ha erughi eru. O kwuru na mmadụ ime mgbatị ahụ nakwa izuike etu onwereike ga-enyeaka kwalite ọnọdụ ahụike onye ahụ n'ụzọ pụrụiche. Kedụ ihe bụ ụzọ mgbapụta Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43690407,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43690407,Ndị Katọlik na-eme ụka nne taa,Ndị jịkọtara aka ọnụ chịkọba mmemme dị iche iche ịjị wee nwee aṅụrị na ụbọchị ndị nne abịakwala ọzọ.,"Ụka nne bụ emume ndị ụka Katọlik ji akwanyere ndị nne ugwu n'ụzọ pụrụ iche N'ụka a kara ndị nne na St Michaels Asata Enugwu, ụbọchị ụka, ndị ụkọchukwu;Fada Callistus Ani na Wilfred Agu kọwara na nne bụ ndị nwere obi umeala ma na ekpokọba ezinaụlọ ha ọnu. Na Holy Ghost Cathedral dịkwa n' Enugwu, Rev. Fr. Peter Acharakpọkuru ndị nna na ụmụaka ka ha gharakwa iji ndị nne gwuo egwu ma ncha. Achara toro ndị nne dịka ndị anaghị ekwe ka ọkụ ọbụla a gụnyere ha na-aka nyụọ. O nyere ọmụmatụ sị na ọ bụ ndị nne jị uka, ma na-ahụ na udo na mbawanye dị na ụwa. Ndị Katolik na Naijiria na-eme ụka nne na-apụta na oge Lent Ndị nne St. Micheals Asata guzobere mmemme dị iche iche dika, ịkwụ n'ahịrị zọ njem ka ndịagha, asọmpị onye nne ka mma nakwa ịwa achịcha bekee. Ndị otu ndị nne nke a kpọrọ CWO nke Holy Ghost Cathedral jị aka ha mee mmemme niile dị na ịka ụka tata ka e were mee ya bụ mmemme. Onyeisi ndị nne Holy Ghost bụ Patricia Achara n'onyeisi ndị nne St Michaels Asata dị n' Enugwu gwara ndị ha ka ha were ụbọchị tata malite ibi ezigbo ndụ nke na ndị agbataobi ha nile ga-ama na ha bụ ezigbo nne na-atụ egwu Chineke. E jiri ọtụtụ ụzọ sị ọṅụ na mmeme ndị nne Fada Achara jịkwa ohere ahụ kpere ndi nne na-achọ mkpụrụ nke afọ ekpere ka ha mụta nwa. Ụka nne bụ mmemme ndị ụka Katọlik na-eme kwa afọ ịjị kwanyere ndị nne ugwu dịka ide jị ụka. Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44537209,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44537209,World Cup 2018: Senegal emeela ihe mba Afrịka ndị ọzọ na-emenwughị,Senegal mere ihe mba Afrịka ndị ọzọ na-emenwughị site n'iji goolu abụọ asatara otu merie mba Poland.,"Ndị Senegal gosiri ndị Poland nkarị ka mba abụọ a zutere n'Iko Mbaụwa. Mba ndị dị n'Afrịka kwụ Senegal n'azụ maka na naanị ha bụ ndị si Afrịka a na-emeribeghị kemgbe asọmpi a bidoro. End of Twitter post, 1 Ha gbara n'ọgbọ egwuregwu nke Spartak na mba Rọshịa. Ka o ruru nkeji 37, ndị Senegal nyere goolu mbụ ha ka Idrissa Gueye gbara bọọlụ kụrụ Thiago Cionek bụ onye Poland n'ahụ ma banye na poostu. Na nkeji 60, M'Baye Niang gbakara neetị Szczesny, mere ka Senegal nweta goolu ha nke abụọ. Goolu ahụ mara ezigbo mma ile anya maka etu bọọlụ si rute Niang si n'ọkara nke ha gbabata ma gbakaa neetị ka Szczesny gbapụtara ezi wee hapụ neetị ya ohere, na-enweghị onye na-eche ya. Ka o ruru nkeji 86, onye Poland bụ Grzegorz Krychowiak, gbakara neetị ndị Senegal, iji sata otu. Mana goolu o nyere emeghị ka ha na Senegal hara n'otu maọbụ nye ha mmeri. Ndị na-agbara Senegal bọọlụ mechara gbawa egwu n'ọgbọ egwuregwu, ebe ndị na-akwado ha welitere olu n'abụ ha na-agụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52618738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52618738,"Covid-19: ""Mmachị dị mma kama ị ga-amachi onye agụụ na-agụ n’ụlọ” - Peter Obi",Peter Obi na BBCIgbo nwere mkparịta ụka n'ụbọchị Tuzde. O kwuru maka ọtụtu okwu a kpụ n'ọnụ.,"Lee ka o siri gaa. Kedu ihe ị chere mmaka mmachị maka coronavirus? Peter Obi zara sị ""Mmachị dị ezigbo mkpa, kama ị ga-amachị onye agụrụ na-agụ sị ya nọro n'ụlo? Onye ahụ ga-apụta iro ka ọ chọo ihe ọ ga-eri."" Obi mara atụ sị ""mba dịka Indịa nyere ndị nke ha akpa osikapa ma nye kwa ha ego nke a mere ka ndị mmadụ kweta nọrọ n'ụlo."" Ọ bụrụ na gọọmentị chọrọ ka ndi mmadụ na-asa aka ha ebe ụfọdụ enweghị ego ha ji azụta ncha na mmiri. Obi kwukwara na ọ dị mkpa ka ebulite ọnụọgụgụ mmadụ ole a na-eme nyocha maka coronavirus. ""Kedu ihe pụtara ihe maka mgbe emere mmachị na Naijirịa?"" Obi kọwara na-nwere ihe atọ dị mkpa e i ama obodo ọnọdụ ya dị mma, ihe atọ a bụ Ahụike, Agụm akwụkwọ na mmadụ ole dara ogbenye. Obodo ọbụla ihe ndị atọ a nọ n'ime ya nke ọma na-aga n'ihu. Kama Obi kwuru na Naijirịa gbara ọnyụpo n'ihe atọ ndị a. Peter Obi ji mba India na Chaina were mma atụ sị na-agbanyeghị na mba abụọ ndịa nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ karịa nke Naijirịa kama achịkọta ndị ogbenye nọ na mba ndịa, na ndị nke nọ na Naijirịa ka nke ha. O kwuru maka agụm akwụkwọ sị ""ntule ziri ezi maka agụm akwụkwọ kwesiri ị bụ ihe dịka passentị iri asatọ kama nke Naijirịa ka nọ passenti iri ise"". Obi kwuru sị ""gọọmentị kwesiri ịkwalite ndị mmadụ ka ha nwee ike ịkpata ego nke ha"". O gara n'ihu kwuo sị ""Ọ bụrụ na igwe Kọmpụta nọ n'ụlọ akwụkwọ anyị niile kamgbe, ụgbụ a emechiri ụlọakwụkwọ ọ ga-adịrị ụmụ akwụkwọ mfe iji igwe kọmpụta amụ ihe"" Maka ntuliaka 2023? Peter Obi kwuru na oge a abụghị oge ndọrọndọrọ ọchịchị dịka coronavirus na-awakpo mmadụ. Kama ọge bụ oge anyị ga-eji bịakọ ọnụ maa tikọọ aka ọnụ merịe coronavirus.kama mgbe nke a mechara na enwere ike ikwu maka ntụliaka 2023. Kedu maka ndị Almajirịa na-abata ala Igbo na-agbanyeghị mmachi? Obi kwuru sị "" mgbe m nọ n'ọchịchị, ahụrụ na obodo niile nwere ndị na-echekwa ha nke a na-akpọ Vigilante. Anyị zụtara ha ụgbọala ma gọọmentị Anambra steeti na-akwụ ha ụgwọ"". Oge eruola ka ndị obodo niile chekwa onwe ha. Nke a ga-eme ka ha chọpụta ndị mmadụ na-ezubata n'obodo ha. Ọ kacha mkpa ugbu a coronavirus na-akpa ike. ""Kedu ihe ị chere maka ndị uweojii na-egbu mmadụ n'ala Igbo?"" Obi kọwara na o nweghị onye kwesiri igbu mmadụ. Kama na ọ dịrị ndị mmadụ ime ka ndị ọchịchi na onyeisi uweojii mara ka onye uweojii ahụ nweta ntaram ahụhụ dịrị ya. Gịnị mere ala Igbo anaghị emepe?"" Ọ bụ ndị a na-achị kwesiri ịhụ na ndị ha tinyere na ọchịchị mezuru ihe ọ kwesiri ime. Ndị obodo kwesiri ijide ndị ha tinyere n'ọchị ka ha mezuo nkwa ha kwere. Kama mmepe obodo bụ ọrụ dịirị mmadụ niile. ""Kedu ihe ị nwere ịkwu maka ọgwụ ọdịnala a sị na-eji agwọ coronavirus?"" Peter Obi kwuru sị "" a kwadoro m etu gọọmentị sị chọọ iweta ọgwụ ndị Madagascar ka ha tule ma ọ dị ire"". Obi kwukwara na Naijirịa kwesikwara ị le anya n'ụlọ maka ọgwụ na ịrụpụta igwe Ventilator. Gee ya n'uju ya ebe a Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43714881,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43714881,Ụmụ Igbo chị ọkụ n'asompi Commonwealth na irite ọlaedo,"Agbanyeghị na ọ dịka ụkwụ mara ndị Naịjirịa gara egwuregwu Commonwealth jijiji na mbido, ụfọdụ n'ime ha na-awapụ ka ọnwa dịka ha nweterela Naịjirịa ọtụtụ ihe nrite n'egwuregwu ahụ.","Nwafọ Igbo Roland buliri kg194 nyere ya akara 224.3 Esther Oyema gbawara ndekọ ụwa wee weta nturuugo ya nke atọ n'egwuregwu ụmụnwaanyị ọlụsị na-ebuli ihe ike. N'aka nke ọzọ, onye otu ya Roland Ezuruike tukwara ugo nke ya n'akụkụ nke ụmụnwoke. Oyema buliri ihe dị kg131 were nweta akara 141.6 nke karịsịrị na ndekọ egwuregwu ahụ n'ụwa niile wee turuugo ọlaedo ebe nwanne ya bụ Lucy EJike nwetara ọla sịlịva. Onye wetara ọlaedo nke atọ bụ nwafọ Igbo ọzọ bụ Ndidi Nwosu. Mana na ngalaba ụmụnwoke, Ezuruike buliri ihe kg194 iji nweta akara 224.3, nke a ka o ji bulie ihe nrite sịlịva o nwetara na Glasgow rue ọlaedo. Ụmụ Naịjirịa na-anọchite Naịjirịa n'egwuregwu ahụ Abdulazeez Ibrahim ritekwara ọlaedo ọzọ n'agba nke ikpeazụ ibuli ihe ike nke ụmụnwoke. O buru kg 220, nweta akara 191.9 Ndị na-echekwa ọlaedo ha dịka Paul Kehinde nwetara sịlịva. Ihe Naịjirịa nwetarala bụ ọlaedo anọ na sịlịva anọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45594768,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45594768,NDIC: Anyị na-enyocha ndị isi ụlọakụ Skye,"Onyeisi ụlọọrụ,'Nigeria Deposit Insurance Corporation' (NDIC) bụ Alhaji Umaru Ibrahim kwupụtara nke a n'ọgbakọ ọzụzụ nke otu a kpọrọ International Association of Deposit Insurers (IADI) Afrịka Regional Committee (ARC) nwere na Legos ụbọchị Wenezde.","Agbanwebuola aha Skyebank ụgboro abụọ Ụmaru kwuru si: . ""A na-enyocha ha. O doro m anya na mgbe oge ruru, ndị ọrụ nchekwa ga-arụ ọrụ ha."" Ọ gara n'ihu kọwa na iweta Polaris bank bụ iji chekwa ego ndị tinyere ego n'ụlọakụ ahụ. NDIC ọkacharamara n'ihe gbarasara ụlọakụ kọwara na ụlọakụ Skye danyere na nsogbu site n'igbazinye ego imeụlọ nakwa ndị biri ego akwụ akwụ n'aka ụlọakụ ahụ nke mere ka e wepụ ndị isi ụlọrụ ahụ n'afọ 2016. Cheta n'izụụka gara aga, ụlọakụ etiti bụ CBN nakwa NDIC nara ụlọakụ Skye ikike ịrụ ọrụ dịka ọbaego ma gụọ ya aha ọzọ bụ 'Polaris Bank', ebe ha tinyere ijeri dọla abụọ n'ụlọakụ ọhụrụ ahụ. CBN kpebiri na ọ gaghị etinyezi ego ọbula na ya bụ ụlọakụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: @MideMrPossible kwuru n' ihe ga-eme mgbe ọzọ ndị mmadụ ga-eru n'ụlọakụ ahụ. @kingboluwatife kwuru na ihe na-atụ ya ụjọ bụ na ọtụtụ ndị mmadụ agaghị enwezi ọrụ maka mgbanwe a. Ndị na-ahụ maka ihe gbasara ụlọakụ Skye Bank kwere ndị na-edowe ego n'ụlọakụ ahụ nkwa na ego ha dị ka ọ dị nakwa ndị ọrụ ha ka nọkwa ya n'agbanyeghị na a gbanweela aha ụlọakụ ahụ. Etu ọ dị ugbua n'ahịa oke Naijirịa, ụlọakụ Skye Bank nwetere uru ruru pasenti 4.05 n'ogo kọbọ 77. A ga-akwụsị ahịa oke ụlọakụ a bido na Monde na-abịanụ. Mgbe BBC Igbo kpọrọ otu n'ime onyeisi ụlọakụ Skye, o tụtụghị ekwentị ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ị ga-alaghachi n'ụlọakwụkwọ pramarị n'okenye?" afirika-49418613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49418613,Ministers and their portfolio: Ihe ndị mịnịsta ga-arụ ugbua,Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola ndị mịnịsta ọhụrụ n'iyi ọrụ taa ma nyekwa onye ọbụla n'ime ha ngalaba ọ ga na-elekọta.,"Mana e nwere ụfọdụ ngalaba nke onyeisiala kewapụtara ọhụrụ. Ha gunyere ngalaba ""Human Affairs, Disaster Management and Social Development; Police affairs, nakwa Special Duties and International Affairs"". Content is not available End of Facebook post, 1 Onyeisiala kewakwara ụfọdụ ngalaba bụ ndị ekpokọtabụrụ ọnụ. Ọmụmaatụ bụ ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik, ọrụ na ụlọ obibi nke a kpọrọ ""power, works and housing"" na Bekee. E kewara ha ụzọ abụọ ka ngalaba nke ọkụ latrik dịrị iche, ebe ngalaba nke ọrụ na ụlọ obibi dịkwa iche. Onyeisiala kpokọkwara ngalaba ""Finance"" na ""Budget and National Planning"" ọnụ. Lezie etu Buhari siri kee ọrụ: Ndị ọzọ bụ Ndị ntorobịa Igbo gara n'ihu kwuo ihe ha chọrọ n'aka ndị minista ọhụrụ a. Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-49115407,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49115407,"Forced penetration: Nwaanyị manye nwoke ka ya na ya nwee mmekọrịta, ọ bụ mwakpo n'ike?","Nwoke manye nwaanyị ka ya na ya dinaa, ọ bụrụ mwakpo n'ike. O kwesịrị ka a kpọọ ya mwakpo n'ike ma nwaanyị manye nwoke ka ha dịnaa?","O kwesịrị ka a kpọọ ya mwakpo n'ike ma nwaanyị manye nwoke ka ha dịnaa? Iwu mba Ingland na Wels sị na ọ bụghị mwakpo n'ike mana nnyocha e mere ọ hụrụ kwuru na o kwesịrị ịkpọ ya mwakpo n'ike. Akụkọ ga-agbarụ obi ụfọdụ ndị na-agụ ya Ọkammụta Siobhan Weare nke mahadum, 'Lancaster University Law School' mere nchọpụta banyere ihe nsori a manyere mmadụ amanye were mee na mba Briten bido na afọ 2016 rue 2017 ma nweta ozi n'aka ụmụnwoke karịrị narị abụọ site na intanet. Nchọpụta ọhụrụ o mere nke e wepụtara n'izụụka a gbadoro ụkwụ na mkparịtaụka ihu na ihu e mere ụmụnwoke dị iri atọ bido n'ọnwa Mee afọ 2018 rue Julaị 2019. Nchọpụta ahụ lebanyere anya kpọmkwem n'ọnọdụ ihe nsori a manyere mmadụ amanye, ihe ọ na-ebute nakwa etu iwu obodo si eso ya. A kpọghị aha ndị sonyere na nchọpụta ahụ mana m ga-akpọ otu n'ime ha John. John kwuru na njirimara mbụ ya hụrụ bụ na enyi ya nwaanyị bidoro merụwa onwe ya ahụ. Nke kachasị yi egwu bụ nke mere e jiri gbara ọsọ buga ya ụlọọgwụ. Ha abụọ mechara nwee mkparịtaụka ihe nwere ike ịbute ụdị agwa ahụ. Ka ọnwa isii gachara, kama ịmerụ onwe ya ahụ, anya ya bịara dị n'ahụ John. John sị, ""Anọ m ala n'obi ụlọ anyị, o si n'usekwu pụta, kụọ m ọkpọ chara ọkụ n'imi, chịwa ọchị, gbafere."" ""Ịkpasa m ike bidoro mewa kwa daa."" Ọ gara ụlọọgwụ hụ dọkịta, nwetakwa ndụmọdụ nleta, a gwa ya hụ ọkachamara ahụike akọ na uche( psychologist) mana ọ gaghị. ""Ọ lata ọrụ, ya asị na ya chọrọ ndina."" ""O bido kpawa ike, o rutere oge m bido na-atụ egwu ya ịlọta ọrụ."" Otu ụbọchị John tetera ụra were hụ na enyị ya nwaanyị ji ịga kụchie aka nri ya n'akwa. O bidoro were isii igwe na-eme ka egwu daa ụda na-akụ ya n'isi, ma were eriri wọghịrịwọghịrị(nylon rope) kee aka ekpe ya, ma manye ya ka ya na ya dịnaa. Egwu na ahụ ụfụ ekweghị John mee ihe ọ gwara ya. Ya mere, nke nwaanyị kụrụ ya ihe ma hapụ ya n'ịga ihe ruru ọkara awa tupu ọ lọghachi bịa tọghapụ ya. Ka nke mechara, o kweghị ka anyị kpaa maka ihe merenụ. O teghị aka, ya adị ime, ịkpa ike kwụsịlata. Mana ọnwa ole na ole ọ mụchara nwa, John tetara ụra were hụ na e ji ịga kedo ya n'elu akwa. Ọ kọwara na enyị ya nwaanyị gbara ya ọgwụ 'Viagra' ma kechie ya ọnụ. Nwoke na-achọ ịtọpụ nwoke akwa ọ wa ""O nweghị ihe m nwenwuru ike ime."" ""E mechara m gaa n'ụlọ ebe a na-asa ahụ nọọ ala. Amaghị awa ole m nọrọ ebe ahụ tupu m gbadaa ala. ""Ihe mbụ ọ jụụ m bụ, ""Ginị ka a ga-eri n'abalị?'"" Mgbe John gbalịlị ị kọrọ ndị mmadụ ihe ọ na-agabiga, o nweghị onye kwenyere. ""A na-ajụ m, gịnị mere na m ahapụghị ụlọ ahụ."" N'ezie, ọ bụ ụlọ m nke m zụtara ụmụ anyị. A bịakwa n'okwu ego, atọkwara m atọ n'ije a."" ""Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ anaghị ekweta n'ihi na ha na-asị, "" gịnị mere na o tie gị , ị naghị etigwara?'"" Mana nke ahụ ka dị mfe n'ọnụ karịa n'omume. ""A sị na m ma gbafuo ọsọ ọsọ."" Ụmụ nwoke ndị ọzọ Dr Weare gbara ajụjụọnụ gabigakwara ụfọdụ n'ime ụdị ihe John gabigara. Otu n'ime ọkammụta ahụ chọpụtara bụ na ndị na-amanye ndịna ndị a bụkarị enyị nwaanyị maọbụ onye buụbu enyị nwaanyị. (Nchọpụta ya lebara anya naanị na mmekọrịta nwoke na nwaanyị), Ndị a gbara ajụjụ kwụkwara na ndị mmadụ anaghị ekwenye na ha kọrọ ha ihe mere ha. Ontu nwoke kwuru na onye uweojii siri ya: ""Ọ tọrọ gị ụtọ, ọ bụghị otu ahụ, ị kara ewetarala anyị mgbesa ọsọ ọsọ."" Onye ọzọ kwụkwara,""Obi anaghị aka anyị ịkọ ihe anyị na ahụ n'ihi ihere. Ị kọrọ, ndị mmadụ anaghị ekwenye maka na anyị bụ nwoke. A ga-awakpoli nwoke?"" Ihe ndị ọzọ Weare chọpụtara bụ: Akụkọ ifo ọzọ bụ na ọ bụrụ na amụ nwoke kelie, ọ pụtara na ọ chọrọ ndina. N'ezie, Weare sị, ""Amụ ikeli bụ ịza oku a kpọrọ ọnarachi"". ""Amụ ụmụnwoke nwere ike ikeli ọ masị ya bụrụ na egwu maọbụ iwe ji ha."" ""E nwekara nchọpụta gosiri na nwaanyị a na-awakpo n'ike nwekwara ike inwe 'orgasm' n'ihi na ahụ ha na-aza oku ọnatarachi. Ya bụ ihe na eme ma nwoke, ma nwaanyị a wakporo n'ike nke a naghị akpa nkata ya ka o kwesịrị mana ihe akaebe gosiri na ọ na-eme."" Ụfọdụ ndị sonyere na nchọpụta Weare mere kwuru na e dinara ha n'ike oge ha ṅụrụ mmanya maọbụ aṅwụrụ nke na enweghị ike igbochi ihe na-eme. Otu n'ime ndị agbara ajụjụ na nchọpụta ahụ kọrọ etu ya na nwaanyị siri lawa n'ụlọ ka ha gachara ụlọ oriri na nkwarị n'abalị ga rie , ṅụọ,. E ruter , ọ maghịzịkwa onwe ya mana ọ na-eche na a gbara ya ọgwụ ike ma dịna ya n'ike. Nwoke ọzọ kwukwara na amanyere ya ndina oge ọ bụ nwaankwụkwọ mgbe ọ na arụ ọrụ oke e mechiri akwụkwọ. Otu nwaanyị ya na ya na-arụ ọrụ nwetara akwụkwọozi ịhụnaanya o degara nwoke ibe ya were gwa ya na iwu bụ na ha abụọ ga-edina , ọbụghị otu a, ọkọọ ndị mmadụ na ya na nwoke ibe ya na-eme enyi. O mere ihe nwatanwaanyị ahụ gwara ya n'ihi na ndị ezinaụlọ ya na ndị ọrụ ha amaghị na nwoke bụ ihe na-amasị ya. Weare kọwara na mirikiti ụmụnwoke sonyere na nchọpụta ahụ hụtara mmanye amanyere ha dịna dịka 'mwakpo n'ike,' ebe ike gwụrụla ụfọdụ n'ime na Iwu Ingland anaghị ahụ ya ka mwakpo. Ọ na-ewutekwa ọtụtụ ha na mba Briten anaghị ahụ ya ka mwakpo n'ike. Otu onye so na ndị sonyere na nchọpụta ahụ sịrị: ""Ikwu na enyi gị nwaanyị ochie ṅụrụ mmanya, manye m ndina dịka nrọ ọtụtụ ụmụnwoke na-arọ."" N'otu akwụkwọ Weare dere ọ kpọrọ ""O, ị bụ nwoke, kedụ ka nwaanyị ga-esi wakpo gị n'ike, nke a abụghị ya ma ọlị"" - ọ rụtụrụ aka na mba Amerịka, ana ụ ndịna n'ike dịka mmekọrịta nke eneghị nkwekọrịta, na steeti Victoria dị na mba Australia, e nwere iwu megidere ndina n'ike site na ""ịmanye nwoke ka ọ banye gị ime ahụ."" Otu na ihe nchọpụta mere bụ ịrịọ ka elebanye iwu gbara mwakpo n'ike anya tọrọ atọ." media-46885390,https://www.bbc.com/igbo/media-46885390,Ihe ise ụmụ Naịjirịa na-atụ anya n'aka IGP ọhụrụ,Ụmụ Naijirịa ma ndị kwe na ndị ekweghị amanyela ọnụ gbasara onye ndu ọhụrụ e wepụtara ndị uweojii Naịjirịa bụ Mohammed Abubakar Adamu.,"Onyeisioche pati PDP bụ Uche Secondus dụrụ ya ọdụ ka o mezie ihe onye ndu uweojii chiburu nu bụ Ibrahim Idris mebesiri ma kwụba aka ya ọtọ. Onye ndu otu APC na Lagos steeti bụ Joe Igbokwe kwuru na ha nabatara Adamu ma gụpụtakwa ihe ole na ole ọ chọrọ ka o lebanye anya. Pati bịakọtara ọnụ a kpọrọ ""Coalition of United Political Parties"" (CUPP) n'ichafu kwuru na ha nabara na ọ ga-adịmma ka Adamu hapụ i so ụkpụrụ ụkwụ onye si n'oche ahụ pụọ. Na nchịkọta lee ihe ise ụmụ Naịjirịa na-atụ anya aka ya dịka BBC Igbo si chọpụta Ha chọrọ ka ọ kwụwa aka ya ọtọ na ntụliaka na-abịanụ, ka ọ ghara ịkwụnyere pati ọbụla karịa ibe ya. Ha chọkwara ka o wepụta ezigbo nchekwa na ntuliaka na-abịanụ ma gbochie igo vootu. Ha chọrọ ka o lebaa anya n'ihe gbasara oke ogbugbu dị n'etiti ndị ọrụugbo na ọchịehi. Ha chọkwara ka o lebaa anya na nsogbu ndị ọzọ a na-enwe gbasara nchekwa obodo Naịjirịa. Ụfọdụ ndị Igbo kwuru na ha chọrọ ka Adamu kwụsị oke ""Check points"" juru na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ụfọdụ kwukwara na dịka etinyerela ndị uweojii ego n'ụgwọ ọnwa ha, na ọ ga-adịmma ka ha wepụta obi ha rụọ ọrụ ọfụma. Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa gụpụtara ọtụtụ ihe onye ndu Adamu nọchịrị ọkwa ya na-emetaghị ọfụma mgbe ọ nọ n'oche, ma rịokwa ya mezie ihe ndị a o mebiri nke mere ndị Naịirịa enweghị ntụkwasi na ndị uweojii. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46820418,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46820418,Modern woman: Iyi mbenukwu na ihe ndị ọzọ ha na-eme ọtụtụ nne anyị emeghi,"Ọtụtụ ihe anyị na-emebu na mbụ, anyi adịghịzị eme ha, ụfọdụ ihe anyi adịghị emebu, anyi na-emezi.","Ụwa na-eme mgbanwe kwa mgbe. Ụmụnwaanyị agbanahụghị mgbanwe nke a. O nwere ụfọdụ ihe ụmụnwaanyị mebukwara ma ha akwụsịghị ike na ya, ma ugbua, ha na-eme ihe ndị ahụ ka ha siri chọ. Ilezie anya nke ọma, ị ga ebido chọputawa ụfọdụ ihe anyị ga-edepụta n'okpuru edemede a. Ọtụtụ ụmụnwaanyị adịghịzị aga ahịa ịzụta akwa maọbụ ihe nri maka onyekwanụ chọrọ ịkwụ n'anwụ ebe ihe niile dịzị na ịnternet? Ọ bụkwa ọ setịpụ ụkwụ n'ụlọ ya, ọ pịa kọmputa maọbụ ekwentị, e wetere ya ihe niile ọ chọrọ ebe ọbụla ọ nọ. N'oge mbụ, ụmụnwaanyị na-eke isi dị iche iche, kama na ọ na-abụkarị isi ojii Mana ugbua, ha na-anwale ụdị agwa sọrọ ha, site na isi na-acha ọbara ọbara ruo na nke na-acha edo edo, ha achọghị ịma. Oge agaala mgbe nwaanyị ga-anọ n'ụlọ, nwoke apụo inwete onwe ya naanị ya. Ugbua, ụmụnwanyị na-akpọrọ ndị enyi ha puo ebe ọ na-akpọtụ, na-enwe anụrị. Anyi ahapụla ima akwa na '19 kporogodom' Oge ima akwa n'obi nọrọ n'ụlọ agafeela. Ugbua ụmụnwaanyị na-eyi chebiriọdụ dị iche iche. I yitekwaraala ihe ndị Bekee kpọrọ 'bum short', anyi amara n'iso na ihe a na-eme. Teknụzụ emeela na onye ọbụla nọ n'ụwa nwere ike ijikọ Nwaanyị agba ọhụrụ ga-akwado, n'eti ka ọnwa, see onwe ya foto, tinye ya n'akara soshal midia ya. Oge adighi. Ụmụnwaanyị dịbu na mbu ete ntecha, kama ugbua, e nwezịrị agwa dị iche iche Ndị bekee agbanweela ntecha, ya bụ na ọ bụzị ihe a na-amụ amụ tupu emebe. Ụmụnwaanyị agba ọhụrụ ejighị ihe Bekee kpọrọ 'makeup' egwu egwu. Ha chọrọ ịdị ka a chọrọ oge niile. Ụmụnwaanyị na-arụbụ ọrụ na mbụ, mana o nwere ụfọdụ ọrụ ha anaghị arụ. Nwaanyị agba ọhụrụ kwetara na ihe nwoke ga-emeli, nwaanyị ga-emelikwa ya karịa. Ya bụ na ọ na-arụ ọrụ ọbụla masịrị ya, nwee ego nke ya o ji eledo onwe ya na ezinụlọ ya anya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50381571,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50381571,Makinde and Adelabu: Ikpe ụlọikpe mkpegharị agbara ndị ntaakụkọ Nigeria gharị,"Ọ bụ otu ikpe, mana ndị ntaakụkọ ụfọdụ na-ede dịka ha si ghọta, ndị na-ede n'elu ebe ndị ọzọ a na-ede n'ala.","2019 Guber election: Mí ò faramọ èsi ìdìbò tó gbé Makinde wolé Ụfọdụ hụtara mkpebi ọkaikpe Abukakar Yahaya dịka ihe masịrị aka na-achị steeti Oyo bụ Seyi Makinde ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ onye ya na ya zọrọ ọchịchị bụ Adebayo Adelabu ka ọ masịrị. Ile anya n'akara google, ịhụ etu mgbagwoju anya a siri kwụru n'ahịrị. kedu nke bụ eziokwu? Ị mata nke bụ ezi ya bụ ihe rara ahụ makana ọkaikpe Yahaya na ndị otu ya ewepụtabeghi ikpe ha n'uju. Dịka ọkaiwu ya bụ Eyitayo Jegede siri kwuo, mkpebi a emetụtaghị ọnọdụ Gọvanọ Makinde. ""Ụlọikpe a ekwughi na ha ekweghi n'ihe Inec mere n'ịkpọpụta aha Makinde dịka onye meriri. Ihe ha kwuru bụ na ha ekwenyeghi n'ihe ụlọikpe ntuliaka kwuru."" Ọkaiwu nke APC bụ Adeboye Sobanjo kwuru na ulọikpe a mere ka a mata na ha kwenyere na mkpesa Maazị Adelabu wetere, mana gbajọọ ị sị ka e megharịa ntuliaka. O kwukwara sị; ""Ọ bụ n'aka onye anyị bịara ozi ka ọ dịzị ugbua. Ọ bụ ya ga-agwa anyị ihe ọ chọrọ."" Ihe nwereike ime Ohere ka dịrị pati abụọ ndị a zọrọ ọchịchị ịga ụlọikpe kachasị nke a kpọrọ ""Supreme Court"" na Bekee. Site n'ọnụ okwu ọkaiwu Sobanjo, Adelabu nwereike isoro ikpe a ruo na ngwụcha. Mana olilanya bụ na Makinde ka ga na-achi ruo mgbe esuru ya bu okwu kpọm." afirika-47696861,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47696861,Dehlia Umunna : Ihe asaa ị maghị maka ada Igbo e ji eje mba,Akụkọ Dehlia Umunna bụ nwa ada Igbo na-achake ka ọnwa na mba ofesi bụ ihe na-ewu na soshal midia ugbua.,"Dehlia Umunna ada Ịgbo ji eje mba n'Amerịka Nwada a bụ onye Naijiria mbụ na-abụ ọkamụta n'okwu gbasara Iwu( Clinical Professor of Law) na mahadum ọkaibe bụ Harvard nke a na-enweta ọkwa ahụ. Tupu e bulite ya n'ọkwa ahụ, Umunna na-akụzi na ya bụ mahadum kemgbe afọ 2007. Ọ natala ọtụtụ nturugo dịka ọkaiwu kajara akaja nakwa onye nkuzi pụrụ iche. End of Twitter post, 1 Nkwenye Dehlia gbadoro ụkwụ na ndụ ya pụtara ihe n'okwu ya. Ọ sịrị, ""Ọ bụ oke na ọrụ dịrị m dịka nwaanyị isi ojii ị bụ ọkaibe iji nye onye ga-eso m n'azụ ebe nlekwasị anya."" Lee ihe ndị ị maghị maka nwa afọ ahụ: 1. Ọ bụ n'ọnwa Eprelụ, afọ 2016 ka o nwetara ọkwa ọkammụta Iwu mana ọ bụ ugbua ka akụkọ ahụ wubere n'ala Naijiria dịka ụmụ Naijiria gara bọlite ya bụ okwu 3. Ada Igbo a dị afọ iri anọ na anọ bụbu onye nkuzi na ngalaba Iwu na mahadum 'George Washington University Law School.' 4. O so na otu jịkọrọ ndị omeiwu nke Massachusetts,MarylandColumbia nakwa New Jersey 5. Ọ gụrụ maka mgbasaozi na mahadum 'California State University' dị na San Bernardino, Mba Amerịka. 6. O mechara nke a nata asambodo na Chịkọta ọha (Masters in Public Administration) na'Harvard Kennedy School of Government.' 7. Umunna gara n'ihu gụọ ihe gbasara Iwu na mahadum, 'George Washington University Law Center.'" afirika-53797432,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53797432,Ị ma na ịgbọ ncha nwereike ime ka utu gị ghara ị na-ekeli ọsịsọ?,"Mmadụ imetu onwe ya aka maọbụ ""ịgbọ ncha"" bụ otu okwu ndị mmadụ anaghị ekwukarị maka ya.","Ọ bụghị naanị ndị Afrịka ka okwu a na-anyị arụ ikwu, o nwere agbụrụ ndị ọzọ dịka ndị India nakwa ndị Chaịna anaghị ekwu maka ya. O nwereike ịbụ n'ihi na ụfọdụ ndị mmadụ chere na ọ bụ ihe ọjọọ maọbụ na ọ bụ ihe atịtị. Mana o nwere uru dị na ya? Lekwa ihe anyị chọpụtara: Uru a dị na ya? Cynthia Fogoe bụ ọkachamara n'ihe gbasara mmkeọahụ chere na o nwere ụfọdụ uru. Ọ gwara BBC Radio na mkparịtaụka ha nwere na uru dị na mmadụ ""ịgbọ ncha"". Lee ihe ndị o kwuru ebe a: Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Chidinma Njoku bụ onye ọrụ ahụike. O kwuru sị ""Ọ bụ ụzọ ị ga-eji mụta maka ahụ gị"" ma kwukwaa na: Ọghọm dị n'ịmetụ onwe gị aka Fogoe gaara n'ihu kọwaa na o nwere ọtụtụ ọghọm sikwa n'ịgbọ ncha pụta. O kwuru na ọ na-arara ọtụtụ ụmụnwoke na-eme ihe a ahụ ịnọte aka ma ha na onye ọzọ na-enwekọ aramara. ""Ị na-eme ihe a mgbe niile, ị ga-akuziri ụbụrụ gị na ọ bụ naanị n'ụzọ ịgbọ ncha ka ị ga-esi nyụọ uhie"". Nke a ga-ebute nsogbu dịka, enweghi ike ikeli utu gị, ịnyụ uhie ọsịsọ, ịnọte aka n'aramara tupu ị nyụọ uhie. Nnyocha ọzọ gosiri na ikiri ihe onyonyo aramara bụ ""pornography"" na Bekee nke na-eso ịgbọ ncha, na-emetụta ụbụrụ mmadụ n'ụzọ ọjọọ. Ọ na-eme ka ndị na-ekiri ya kwụsị ịnwe agụụ mmekọrịta n'ebe nwunye maọbụ enyi ha nwaanyị nọ. Ụmụnwaanyị a na-eme ya? Ụfọdụ na-eche na ekwute okwu mmadụ igbo onwe ya agụrụ mmekọahụ, ọ bụ ụmụnwoke ka a na-ekwu maka ha. Mana Radhika Sanghani bụ onye ntaakụkọ ma maka aramara kwuru na nke a bụghị eziokwu. Sanghani kwuru na ""ụmụnwaanyị na-eme ya mana ọ bụghị ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya chaa chaa"". Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: Ọrụ ugbo m na-arụ si m n'obi pụta" 45854203,https://www.bbc.com/igbo/45854203,"Dasuki, Olisa Metuh na Dokpesi so na mmadụ 50 a machiri ịga njem mba ọzọ",Gọọmenti etiti ewepụtala aha mmadụ 50 ha machiri ịhapụ Naijiria ga mba ọzọ. n'ihi ebubo metụtara nrụrụaka.,"Ụlọọrụ ntaakụkọ 'The Nation Newspapers' bụ ndị dere akụkọ a kọwara na ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garuba Shehu kwuru na, aha ndị a siri n'aha ndị ha na ngalaba na-ebu agha megide nrụrụ aka bụ EFCC n'aha ịchafụ, ICPC nakwa ndị uweoji nwere ikpe. Ndị a gụnyere onye ndụmọdụ gọọọmenti n'ihe gbasara nchekwa n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan bụ Sambo Dasuki. Iwu ọhụrụ ahụ metụtakwara mmadụ 11 chịbụrụ gọvanọ: 1. Orji Uzor Kalu -Abia 2. Chimaroke Nnamani -Enugwu 3. Gbenga Daniel -Ogun 4. Rasheed Ladoja -Oyo 5. Adebayo Alao-Akala -Oyo. 6. Murtala Nyako -Adamawa 7. Muazu Babangida Aliyu -Niger 8. Gabriel Suswam - Benue 9. Sule Lamido - Jigawa 10. Ibrahim Shehu Shema - Katsina 11. Saminu Turaki - Jigawa Ndị rụburu Mịnịsta mmadụ asaa: 12. Femi Fani-Kayode 13. Abba Moro 14. Nenadi Usman 15. Bashir Yuguda 16 Jumoke Akinjide 17. Bala Mohammed 18. Ahmadu Fintiri Ndị bụbu ndị isi ọrụ nchekwa o metụtara bụ: 19. Air Marshal Alex Badeh - Chief of Staff 20. Vice Admiral A. D. Jibrin - Chief of Naval Staff 21. Air Marshal Mohammed Dikko Umar -Chief of Air Staff 22. Sunday Ehindero - Inspector-General of Police 23.Air Marshal Adesola Amosu - Chief of Air Staff Ndị ọrụ ikpe o metụtara bụ: 24. Jọstis Innocent Umezulike -Onye bụbu Chief Judge Enugwu steeti 25. Jọstis Rita Ofili-Ajumogobia -Onye bụbu ọkaikpe ụloikpe ugwu nke etiti 26. Ricky Tafa -SAN 27. Dele Belgore -SAN Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị/ojiegoahcuegoo metụtara gụnyere: 28. Olisa Metuh - Onye bụbụ Odeakwụkwọ mgbasaozi PDP 29. Raymond Dokpesi - Onye bụbu onyeisioche ụlọọrụ ntaakụkọ AIT/ Raypower 30. Jide Omokore - Ojiegoachụego 31. Waripamowei Dudafa -Onye bụbụ onye nyemaka Goodluck Jonathan n'ihe na'eme n'ụlọ Fani Kayode akatọọla mmachi ahụ Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu n'oge ọchịchị Goodluck jonathan bụ Femi Fani Kayode akatọọla mmachi ahụ. Fani Kayode kwụrụ na igwe Twitter ya na ị machi ngharị ndị mmadụ na enwetaghị ikike ụlọikpe ọbụla bụ ""ihe ihere na ihe kwesịrị nkatọ."" Fani Kayode bọrọ Buhari ebubo ọchịchị aka ike nakwa ị naghara ndị ọrụ ikpe ọrụ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45457782,https://www.bbc.com/igbo/45457782,Africa-China Cooperation: Ụmụ Naịjirịa achịpụtala Buhari ụkwụ n'ama,Ụmụ Naịjirịa agala n'elu soshal midia ikwupụta ebumnobi ha nye onyeisiala Muhammadu Buhari maka ego o bitere na mba China dịka o mere njem gaa ebe ahụ n'izuụka a.,"Buhari gara China maka ọgbakọ mmekọrita China na mpaghara Afrịka nke a kpọrọ 2018 China Beijing Summit of the Forum on Africa-China Cooperation na Bekee. Buhari bitere ego ruru nde dọla 328 n'aka ndị China mana ụmụ Naịjirịa anabataghị ya. N'elu Twitter, ha mapụtara n'ike na ebube na-agwa Buhari etu ọ dị ha n'obi. Idama mere mgbakọ na mwepụ banyere ya bụ ego ma kwuo na ihe ọ pụtara bụ na ndị Naịjirịa niile ji China ụgwọ puku naịra iri na ise (15,000) na otu na otu. N'akụkụ nke ya, Olanrewaju Olumoh kwuru na ụgwọ Naịjirịa ji akarịala akarị gụnyere ego nke a o bitere ọhụrụ. Abrahama MUFC na-ajụ etu Naịjirịa ga-esi kwughachi ego niile ha na-ebite China ka China ghara ịbịa were ala Naịjirịa na nkwughachi. Darius kwuru na ntọala a Buhari tọrọ abụghị nke ọma ya ebe Crowned Emmanuel na-ekpe ekpere ka Buhari nọrọ ndụ ka a kwụsịa ụgwọ niile a. Mana Mayowa Adeleye na-ajụ ka a kọwara ya etu gọomenti Buhari bụ ndị kwekọrịtara ka e kee ego Abacha zuru bụ nde dọla 322 mechara gaa bite nde dọla 328 na China. Ụfọdụ kwadoro ihe Buhari mere Agbanyeghị nkatọ niile ahụ, ụfọdụ na-ekwukwa na ihe onyeisiala mere bụ maka ọdịmma obodo. Comrade Abubakar kwuru na ego ndị China dị ọnụala ịkwụghachi, ma kwuo ka Naịjirịa gaa n'ihu bite iji kwalite obodo. N'akụkụ nke ya, Yaqoob Qaseem kwuru na ọ ga-abụ ezi njehie ma ụmụ Naịjirịa wepụ Buhari na ntuliaka 2019 maka na ya nwere ntụkwasị obi ebe ọ nụ. Onyeisiala Buhari kwuru na ego ahụ e bitere China bụ iji kwalite ngalaba teknụzụ Naịjirịa. Mana egwu na-atụ ụmụ Naịjirịa na ọ bụrụ na a kwụghachighị ego ahụ, China ga-abịa were ọtụtụ akụnaụba Naịjirịa dịka nke ha etu ha si eme na Zambia ugbua. Kama onyeisiala agwala ha nwee olileanya na ntụkwasịobi na azụmahịa ha ji ego ahụ eme ga ebido ritewe elele. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50976254,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50976254,Fulani Herdsmen: Ihe mere ndi ji egbe jiri gbuo mmadụ 19 na Kogi steeti,Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị ji egbe wakporo obodo Tawari dị na Kogi steeti gbuo mmadụ 19 n'abali foro Fraide.,"Akwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ William Aya gwara BBC na Kogi steeti si "" Ha gburu mmadụ iri na itoolu ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ."" Ọ gara n'ihu kwuo na Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ede Ayuba Ekpeji agaala njem nleta ebe ihe mere ma zigakwuo ndị ọrụ ya ebe ahụ. Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ndị ochi ehi bịara ịbọ ọbọ kpara mkpa mkpa ahụ. O kwuru na onyeisi ndị uweojii suo ọtụtụ ụlọ ọkụ Ihe Donald Trump kwuru maka mba Iran na-aba Dịka Iran na-aba mba imemila mba Amerịka maka ogbugbu ọchịagha ha bụ Qasem Soleimani ka Donal Trump na-ekwu na oteela aka ekwesiri igbu Soleiman. Trump kwuru na aka Soleimani dị na ogbugbu ọtụtụ ndị mba Amerika ma na-akpakwa nkata igbu ndị ọzọ tupu ha egbuo ya. Iran aṅụọla iyi ịbọ Amerịka ọbọ maka ọnwụ Qasem Soleimani Ọchịagha Soleimani Ịran aracharala aka n'ala ṅụọ iyi sị na ha ga-abọrịrị Amerịka ọbọ maka ọchịagha Qasem Soleimani, bụ onyeisi ndịagha mba ha, Donald Trump gburu. N'ihi nke a, ụlọọrụ nnọchiteanya Amerịka dị na Baghdad agwala ndị mba ha ka ha were ọsọ, were ije gbapụ n'Ịraq ozugbo. Nke a na-abịa ka ndịagha mba Amerịka gburu Ọchịagha Soleimani bụ onyeisi ndị agha Quds Force, na mba Ịrak n'isi ụtụtụ Fraide. Ndị isi ụlọọrụ ndịagha mba Amerịka nke e ji Pentagon mara, kwuru na ọ bụ Onyeisiala Donald Trump ziri ha ozi ha gara. Souleimani na ụfọdụ ndị ọzọ si n'ọdọụgbọelu dị na Baghdad apụta mgbe ogbunigwe na-efe n'ikuku bịara tụọ ha. N'otu aka ahụ, ndị Quds Force akpọpụtala aha Brigadier General Esmaeil Qaani dịka onye ga-anọchi Soleimani. Nke na-eme na Fraansị Ndịụwe ojii Fraansị ka na-agba ndị akaebe ajụjụ maka ihe mere Nke na-eme ụgbụ a bụ na ndịuweojii mba Fransị egbuola nwoke ji mma merụọ ndị madụ anọ ahụ n'obodo Villejuif. ụfọdụ na-ekwu na nwoke ahụ yi ogbunigwe n'ahu ya kama ndị uweojii ka na-eme nyocha ha. Super Eagles abụrụla nnanna ọzọ Oro nwa oo!!! Aka na-aghọrọ Super Eagles goolu bụ Francis Uzoho na nwunye ya aghọrọla nwa nwoke. Dịka o kwuru, ahụ dị nne na nwa mma. A gbapụtala mmadụ 147 n'aka Boko Haram Ndị agha Naịjirịa tọghapụrụ mmadụ otu narị na iri anọ na asaa gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị nke Boko Haram jibu eji. Ha kwuru na ha gbapụtara ndị a ka ha na ndị oyindụegwu ahụ kwakọrịtachara mgbọ n'okpuruọchịchị Guzambala dị na Borno steeti. Gana achụchaala ndị nchịkọta ha Kwesi Appiah bụ onye nchịkọta otu 'Black stars' so na ndị ọchụchụ a metụtara Ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ na mba Gana, achụọla ndị niile na-achịkọta otu egwu bọọlụ na mba ahụ ụkwụ eru ahịhịa. Ọchụchụ a metụtara ma ndị na-elekọta otu nwoke ma ndị nwaanyị. Ha kwuputara nke a n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020, ebe ha nọkwa kelee ndị nchịkọta niile ahụ maka ""mbọ niile ha gbaara egwuregwu na Gana"". Ụmụaka anọ so na mmadụ 18 nwụrụ ka ụgbọelu kpọkasịrị Nke a abụghị foto si n'ihe mberede mere na Sudan Ụmụaka anọ so n'ihe ruru mmadụ iri na asatọ nwụrụ ka otu ụgbọelu ndịagha kpọkasịrị na mba Sudan n'abalị. Ụgbọelu ahụ kpọkasịrị na-erughi nkeji ise o si n'ọdọụgbọelu dị n'isiobodo El Geneina dị na West Darfur felie. Ụgbọelu ahụ kpọkasịrị bu ihe enyemaka a na-ekenye ndị agha dị n'etiti agbụrụ ole na ole metụtara. Amer Mohammed al-Hassan bụ ọnụ na-ekwuchitere ndịagha na mba ahụ, gwara ụlọntaakụkọ AFP na ndị nwụrụ gụnyere mmadụ asaa bụ ndị na-arụ n'ụgbọelu ahụ, ụmụaka anọ, ndị nkịtị asatọ nakwa ndị ọkaikpe atọ. Awakpoghi ụgbọoloko ọbụla Ndị ụlọọrụ ụgbọoloko na Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ntọ mmadụ wakporo ụgbọoloko si Kaduna aga Abụja ụnyaahụ. Fidet Okhiria bụ onyeisi ngalaba Nigerian Railway Corporation, kwuru sị na naanị ihe mere bụ na mmadụ mara ụgbọoloko ahụ okwute. 2020 a bụ afọ Liverpool? Liverpool egosila na anya ha dị n'ibulite Iko Premier League n'afọ a, ka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie Sheffield United. Mmeri a emeela ka ha jiri pọịntị iri na atọ na-aga Leicester City bụ ndị na-achụ ha n'azụ na tebulu. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee emume ịwa akwa ndị Obowo" afirika-45861111,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45861111,Orji Uzor Kalu: Onweghi ihe dịka mmachi njem,Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia Steeti ekwuola na onweghi okwu banyere akụkọ na-ekwu na aha ya so na ndị a machiri ime njem na mba ofesi.,"N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, O kwuru na onweghi ihe nke ahụ pụtara na ọ gaghị aza ajụjụ banyere ya. Kalu Kwuru na okwu a abụghị ihe a na-etinye ọnụ na onweghi ihe dị etu ahụ. Cheta na akụkọ kwuru na onyeisiala Buhari nyere iwu ka a machie ọtụtụ ndị site n'ime njem a ga mba ofesi bụ nke PDP, Afenifere na ndị ọzọ katọrọla. Mana onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onweghi aha ndị amachiri ime njem ha wepụtara na ọ bụ nke ha ritere n'aka ọchịchị gara aga. Gịnị bụ Ikike iwuOnyeisiala: Onye ọkaiwu bụ Godwin Uwazuruike kọwaara BBC Igbo ihe bụ ikike iwu onyeisiala akpọrọ 'Executive Order' na bekee. O kwuru na iwu a na-enye onyeisiala ikike ịmachi njem onye ọbụla ha na-enyocha mere ihe ọjọọ ka ọ ghara ịgba ọsọ. O kwuru na iwu esighi n'aka ndị ọkaiwu ma ọ bụ ndị ụlọomeiwu nke Naịjirịa pụta na onyeisiala enweghi ikike inye ụdị iwu dị etu a. Uwazuruike kwuru na ọ bụ naanị ndị ụlọomeiwu nwere ikike ime iwu, ebe ndị ọkaiwu na-achabi iwu mana onyeisiala enweghi ụdị ikike ahụ. O kwuru na mkpebi bụ imegide ikike ndị ụlọomeiwu na ndị ọkaiwu na ọ bụghi ihe ziri ezi dịka ọkaikpe nyere ha ikike ji dọọ ha aka na ntị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43586564,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43586564,Melaye chọrọ ịgba onyeisi uweojii akwụkwọ ma elekere 48 gafee,"Sinetọ Dino Melaye enyela Ibrahim Idris bụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa iwu sị ya kpọpụta mmadụ abụọ sị na o nyere ha egbe, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka ya bụ Melaye kpọpụ ya ụlọikpe.","Ibrahim Idris na Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchite anya ndị Kogi West na-akwata ya maka ebubo mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchiri boro ya Melaye kwuru sị na ọ na-enye ya nanị elekere 48 nke bụ mkpụrụ ụbọchị abụọ, iji kpọta ndị a, maọbụ ọ kpọga ya ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya maka mmegide, iji iyi egwu anapụ mmadụ ihe nke bekee kpọrọ blackmail, nakwa mmekpa ahụ nke echiche nke bekee kpọrọ mental assault. Cheta na ụnyaahụ,onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa enyere iwu ka e wepu kọmishọna ndị uweojii na Kogi steeti bụ Ali Janga. Nke a bụ maka mmadụ isii ndị boro Dino Melaye ebubo na o nyere ha egbe gbanahụrị ndị uwe ojii ebe a kpọsara n'isi ụtụtụ. Ha gbafuru tupu ndị uweojii enwe ike kpụpụ ha n'ụlọikpe ukwu dị na Lokoja. Akụkọ ga-amasị gị Ihe Melaye nwere ikwu Ka Melaye nọ n'ime ụlọomeiwui, o kwuru na ndị mmadụ chetakwa na aka onye eboro ebubo ga-adigide ọcha ruo oge a mara ya ikpe. O kwuru nke a gbasara mmadụ abụọ ndị ahụ a na-enyo enyo ndị uweojii sị na ha tụrụ ya aka. Ihe Melaye dere n'igwe okwu Twitter gosiri na obi dị ya ụtọ na agaghị ekpe ikpe gbasara ya n'ụlọikpe dị na steeti ya bụ Kogi. Dịka o kwuru, a ga-ekpezi ikpe gbasara ya n'ụlọikpe ukwu nke gọọmentị etiti dị n'Abuja." afirika-46808427,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46808427,Minimum wage: Anyị ga-akwụ ihe ọbụla ụlọomeiwu etiti kwadoro n'iwu - Kọmịshọna mgbasaozi,Anambara steeti ekwupụtala njikere ha dị n'itinye n'ọrụ mkpebi ọbụla ụlọomeiwu etiti ga-eme n'ụzọ iwu gbasara ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ obodo.,"Otu ọgbakọ nke otu atọ mejupụtara, nke a kpọrọ 'tripartite Committee' nke gọọmentị etiti hiwere mabụrụkwa nke Ama Pepple nọ n'isi ya, nọọrọ n'afọ gara aga kwupụta ka puku naịra iri atọ bụrụ ụgwọọnwa opekatampe e kwesiri ịkwụ ndịọrụ obodo Naijiria. End of Twitter post, 1 Kọmịshọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasaozi bụ Chukwuemeka Adinuba gwara BBC Igbo n'ekwentị na "" Anyị kwetara na ego a na-akwụ ndịọrụ anaghị ezu. Ihe ọbụla ụlọomeiwu etiti kwetara anyị ga-akwụ ya."" Ndịọrụ Nigeria na-esi ọnwụ na ụgwọ opekatampe ga-abụlrịrị N30,000 Onye odeakwụkwọ ukwu nke steeti ahụ bụ Solo Chukwulobe nọọrọ ụbọchị Tuzde oge ndịọrụ mere ngagharịiwe na steeti ahụ ma kwupụta na ndịọrụ obodo kwesiri ka e bulitekwuo ụgwọọnwa opekatampe ha, ma lebakwuo anya n'usoro akụnaụba nke Naijiria ka ọdị taa. Cheta na Minista na-ahụ maka ndịọrụ bụ Chris Ngige nọọrọ n'ọgbakọ ya na ndịndu otu ndiọrụ mere, kwee nkwa na gọọmenti etiti ga-anọ n'abalị 23 nke ọnwa Jenụwarị, 2019, ma wegara ụlọomeiwu etiti Naijiria atụmatụ iwu ndịọrụ ka ha leba ya anya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49852029,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49852029,Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnọdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa na-azụ ahịa na Ghana,Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Kumasi.,"Ọ gwara BBC na o teela ndị Naịjirịa na-atụ mgbere na Gana na-ahụsị anya na njem ịtụ mgbere na mba ahụ. Ọ kwuru na iwu mba Gana wepụtara maka ndị oji ego achụ ego si mba ọzọ bụ ihe mmekpa ahụ. Mana, ndị Gana na-ekwu na ọ bụghị eziokwu. Ha kọwara na ha anaghị achụ ndị Naịjirịa, na ọ bụ ihe iwu obodo ha kwuru ka ha na-eso. Uche ha bụ ka ndị Naịjirịa ghara iso ha na-atụ mgbere nke ịrepụ obere obere dịka iwu kwuru. Ndị Naịjirịa na onwe ha si na nke a ga-esiri ha ike maka etu ọnọdụ mgbere si dị na mba ahu. Lee akụkọ a n'uju. Ọrụ a si n'aka Chiemela Mgbeahuru na Chimamaka Ihenacho. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50970139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970139,Bukola Saraki: Gọọmentị Kwara akụtuola ụlọ Saraki,"Otu PDP akatọọla nkwatu gọọmentị Kwara steeti kwaturu ụlọ Sinetọ Bukola Sarakị, si na ọ bụ mkpagbu otu ndọrọndọrọchịchị ndị anọghị na gọomentị.","PDP akatọọla Gọọmentị Kwara maka ikụtu ụlọ Saraki Ọ bụ n'isi ụtụtụ Tọzde ka a kuturu ụlọ ahụ Gọọmentị Kwara Steeti kụturu ụlọ Saraki n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde, bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020. N'ozi PDP wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbodiyan binyere aka, pati ahụ kwuru na ọ bụ ""akpọmasị nakwa enweghị obi ịnabata ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ"" mere ọchịchị APC na steeti ahụ ji kpaa ụdịrị agwa ahụ. Gọọmentị Kwara kụturu ụlọ Saraki Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Ndị nọ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ọ bụ n'elekere anọ nke ụtụtụ ka ụgbọala katapila gara pịatuo ụlọ ahụ. Ọ bụ nna Bukola Saraki bụ Olusola Saraki nwe ụlọ ahụ wee nyefee ya nwa ya. Ụlọọrụ gọọmentị bụ nke a chọrọ ịrụ n'ala ahụ Mana gọvanọ Kwara Steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq, kwuru na gọọmentị ewegharala ala ahụ. O kwuru na gọọmentị ga-arụ ụlọọrụ maka ndị ọrụ steeti n'ebe ahụ. N'aka nke ya, Saraki kwuru na ya bụ ihe bụ mmegbu nke gọọmentị na-emegbu ya na ezinaụlọ ya. O kwuru na ya ga-aga ụlọikpe ịga gbaghaa ya bụ ihe. Saraki mechara kelee ndị mmadụ gosiri ya nkwado dịka akụkọ ihe mere wusara ebe nile. Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam ga-emepe tupu a gbaa Ista - Gọọmentị Etiti Minista na-ahu maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwela nkwa ma kwubie na ọdọụgbọelu nke Akanu Ibiam dị na Enugwu steeti ga-ebido ọrụ tụpụ emee emume Ista nke afọ a. Sirika kwuru nke a mgbe ọ gara ngagharị ile otu ọrụ si aga n'ọdọ ụgbọelu ahu ma kwuo na obi dị ya mma etu ọrụ si aga. Ọrụ na-aga maka ịrụcha ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dịka goọmentị siri kwuo Osote onyeisi Gọvanọ Enugwu steeti bụ Oriaku Cecelia Ezilo kọwara maka mkpa ọdọụgboelu a dịịrị ndị Igbo ma kwuo kwa na Gọomentị Enugwu Steeti dị Njikere ịhụ na-arụchara ya. N'otu aka ahụ ka omeiwu Nnoli NNaji kwukwara na ụloọmeiwu emezuola ihe niile ha kwesiri ime iji hụ na ya arụchara ọrụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam. Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020 Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020 Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba bụ Bismack Rewane agbaala ama n'ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020. Rewane, onye nwe ụlọọrụ 'Financial Derivatives' kwuru nke a n'ọgbakọ ụtụtụ nke Lagos Business School mere na nsonso a. Ọ sịrị na ihe ga-akpata ụkọ ego bụ mbuli ego ụtụisi VAT site na pasent ise rue pasent asaa na ọkara, mbuli ego ọkụ latrik nakwa iweghachi 'toll gate'. O kwuru na nzọpụkwụ ndị a ga-ebute oke ọnụahịa. Mana Rewane gara n'ihu kwuo na ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ ga-eme ka ndị ọrụ kụrụtụ ume ndụ. Ihe NBA gwara Buhari maka afọ ọhụrụ Onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu bụ Paul Usoro Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ 'Nigeria Bar Association' adọọla aka na ntị ka ihe bere n'afọ 2019 ghara ibekwa na 2020. N'ozi afọ ọhụrụ ya, onyeisi otu ahụ bụ Paul Usoro gwara gọọmentị ka ha sepụ aka n'inupu isi na iwu obodo nakwa mkpebi ụlọikpe bụ nke e ji mara ha n'afọ gara aga. O kwuru sị: ""N'afọ 2019, ndị ọchịchị leghara iwu Naịjirịa anya ugboro ugboro n'ihi nnupu isi na ọchịchị aka ike ha."" ""Ọ bụ na 2019 ka e wepụrụ ọtụtụ ndị n'ọrụ na-esoghị ụzọ iwu kwuru."" ""Onye nke mbụ bu Okaikpe Walter Onnoghen e wepụrụ na mbido afọ 2019. Onye nke abụọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Corporate Affairs Commission' bụ Azuka Azinge."" Usoro gbarụkwara ihu maka etu ndị uweojii nzuzo bụ DSS si wakpo ụlọikpe dị n'Abuja wee nwụchie Omoyele Sowore bụ ụlọikpe ahụ nyere iwu ka a tọhapụ ya. O kwuru na mmechi na ""anyị na-atụ anya na gọọmentị ga-aga n'ihu irube isi na mkpebi ụlọikpe niile dị na Naịjirịa."" Maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi Abike Dabiri Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na Ụlọomeiwu Naịjirịa kwesịrị ileba anya etu a ga-esi mee ka ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi na-esonye na ntuliaka. Dabiri-Erewa kọwara na nke a bụ n'ihi na ndị bi mba ofesi na-enyere akụnụba Naịjirịa aka nke ukwu. O kwuru na gọọmentị etiti ga-agba ịhụ na nke a mezuru. Ọkụ na-agba n'Ọstrelịa Ọkụ ahụ agbapịala ọtụtụ ụlọ ma gbuo mmadụ iri na asatọ A dọọla ndị gara njem nlere anya na mpaghara ụfọdị na mba Ọstralịa ka ha kwara ngwongwo ha laa n'ihi ọkụ ọgbụgba na-agbasa n'ike n'ike. Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na asatọ anwụọla na ya bụ ọkụ ọgbụgba ebe ihe karịrị otu puku ụlọ na narị abụọ alaala n'iyi. Okụ a bidoro ịgba n'ọhịa dị icheiche kamgbe ọnwa Septemba afọ 2019. Nke mere na Kenya na Sudan Mmadụ iri atọ anwụola dịka ọgbaaghara dapụtara n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ n'obodo Dafur dị na mba Sudan . Nke a na-eme dịka ndị Al shabbab gburu mmadụ atọ n'ime ụgbọala ha ji eme njem n'obodo Lamu nke dị na mba Kenya. Arsenal emeriela Man Utd Pepe nyetere ofu goolu n'asọmpi ahụ Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ. Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde. Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Lee emume mgba ndị Imerienwe" afirika-48973721,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48973721,Serena Williams: Simona Halep egosila ya ihe ọkụ ji ntị oke eme,Akụkọ kpụ ọkụ n'ọnu n'ụtụtụ a,"Simona Halep meriri Serena Williams N'egwuregwu, ọ dịka agadinwaanyị akawala nka n'egwu ọ ma agba ebe Simona Halep meriri Serena William na asọmpi tenis apịara ụbọchị Satọde na Wimbledon. O ji 6-2 6-2 merie Serena na nkeji 56"" ebe ọ nọ kwuo na ya apịnubeghị ụdị bọọlụ a mbụ. Serena eturula ugo Grand Slam ugboro iri abụọ na atọ (23) ebe Simona Halep ritegoro ya naanị ugboro otu ugboro. Sịnatọ Abbo abanyela na nsogbu ọzọ Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwụ na ndị omekome wakporo be Sen Ishaku Abbo n""Adamawa steeti n'isi ụtụtụ satọde ga tọrọ nwunye nna ya ma gbagbuo nwanne nna ya. Sinatọ Abbo bụ onye gwara BBC nke a n'ehihie sị na ya amaghị ma ọgbasa gbagharị ọ nọ n'ime ya maka nwata nwanyị asị n'ọmara ụra. Christian Chukwu alọtala Chukwu bụbụ onye nchịkọta otu Super Eagles N'akụkọ ọzọ, Christian Chukwu bụ onye bụbu onyendụ Super Eagles bụ nke gara ụlọọgwụ na mba ofesei maka ọrịa ọ dara abatala n'ahụike. Chukwu gara kelee Femi Otedola bụ onye nyere ya nkwaodo ojiri mee ya bụ njem n'ọnwa Mee. Otedola sị na obi dị ya mma ka ya siri nyere Chairman Chukwu aka karịa ịwere ya bụ ego ṅụọ mmanya. Ọ sị na ya mefuru ihe ruru nde Naịra iri atọ na isii na ụma (N36, 635,000) n'isi Chukwu. Adaala Facebook nha ijeri dọla ise maka amaghị eme Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị N'ofesi, ngalaba nke Federal Trade Commission nke mba US ekpebiela na Facebook ga-akwụ nha dị ijeri Dọla Ise maka ịresị Cambridge Analytica aha ndị mmadụ maka ntuliaka 2011 n'US. Iwu kwuru na Facebook kwesiri ịgwa ndị mmadụ tupu ha emee otu a, mana ọ dịghị ka ha emere ya. Gee nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Na Kano nwaanyị wụru di ya mmiri ọkụ Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa Lauratu Ahmad ji iwe na di ya bụ Aliyu Ibrahim Fayan-fayan ha ahazi ịlụ nwaanyị nke abụọ were jiri mmmiri ọkụ saa di ya ahụ. Fayan-Fayan na-anata ọgwụgwọ ugbua sị na nwunnye ya gbara ọsọ ka ọkpachara mkpa mkpa a. Ọ gwara ụlọ ntaakukọ Daily Trust sị, ""Ka m gwara ya na m chọrọ ịnụta nwaanyị ọhụrụ, onweghị mgbanwe m hụrụ n'agwa ya. Nke kachasị bụ na ọ gwara m na ya ga-eso ndi ga-azụ ihe a ga-eji mee agbam akwụkwọ."" Fayan-fayan sị na ọ bụ ka ọ lọtara n'abalị na-ege redio ka nwụnye ha buru miiri ọkụ wụọ ya n'ahụ. Nwoke a nọzị anata ọgwụgwọ na ụlọ ọgwụ ọha dị na Danbatta sị na ọ bụ ụmụ 10 ka ya na nwunye ya ji. Ndị omekome egbuola nwa onyeisi Afenifere Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ndị ntọrị gburu Funke Olakunrin bụ nwa onyeisi otu jikọrọ ndị Yoruba bụ Afenifere. Ha sị na ndị a e che na ha nọ njem ntọrị ruru mmadụ iri na ise si ọhịa pụta wee wakpo ụgbọala abụọ na-agba n'okporo ụzọ dị nso n'obodo Ore Ndị omekome egwuola ọtụtụ mmadi na Somalia Al Shabab has carried a string of deadly attacks in Somalia in recent years Ihe ruru mmadu asaa anwụọla na mba Somalia dịka ndi omekome bu ọgbọala ha kwajuru ogbunigwe baa n'ime ụlọ ndina na obodo Kismayo. Anya hụrụ alụ a kwuru na ndị oji egbe so kwa na ndị mere mwakpo a Ndị otu al-Shabab si na ọ bu ha kpara ike a. Serena ga-ezute Halep taa Ọka ibe n'ịpịa bọọlụ tennis bụ Serena Williams na-achụ iko Wimbledon nke asatọ ya taata mgbe ọ ga-ezute Simona Halep. Williams emeriela Halep ugboro itoolu n'ime ugboro iri ha zutere n'asompi tennis Gee nkeji ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyi taa: Widowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ" afirika-55772884,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55772884,Covid Vaccine: Etu Afrịka si eche ebighebi maka ọgwụ mgbochi covid-19,"Afrịka ga-eche ""izu kwuru izu maọbụ ọtụtụ ọnwa"" tupu ọgwụ mgbochi nke ngalaba WHO binyere aka erute ha aka, dịka ndị ọrụ dị iche iche na-agba mbọ ịhụ na ọgwụ mgbochi ruru Afrịka aka si kwuo.","A rụpụtala ihe ruru ọgwụ mgbochi nde 900 site n'atụmatụ dị iche iche, nke ga-ezu ịgba ihe ruru pasentị 30 n'ime mmadụ otu ijeri na ụma atọ (1.3b) nọ n'Afrịka n'afọ a. Mkpachido nke ndị mba nwere nnukwu akụnaụba na-akpachi, enweghi ego e ji akwado, iwu nakwa ihe ndị ọzọ gụnyere n'ihe ndị na-eme ka usoro e ji ebuputa ọgwụ mgbochi ndị a na-akpụ ka eju. ""Ụwa nọ n'oge ịda mba, mana ọ bụ ndụ ndị mmadụ nọ na mba ndị enweghi ego ka a ga-eji chụọ aja,"" ka Tedros Ghebreyesus bụ onyeisi ngalaba WHO kwuru. E kesaala ihe ruru ọgwụ mgbochi nde 40 na mba 49 bụ ndị nwere ego, mana ọ bụ naanị mkpụrụ 25 ka e kerela n'ime naanị otu n'ime mba ndị na-enweghi ego, dịka Tedros si kwuo. ""Ọ bụghị nde 25, ọ bụghị puku 25, naanị 25 nkịtị,"" ka o kwuru dịka ọ na-ekwughi mba nke ọ bụ. Mana ka ọ dị ugbua, enwebeghi ọgwụ mgbochi ọbụla nke si n'ofesi e nyerela onye ọbụla n'Afrịka, ka ọnwa abụọ e bu ụzọ wepụta ya na mpaghara Yurop gachara. Otu kpọrọ onwe ha ""The People's Vaccine Alliance"" chọpụtara na ""mba ndị nwere ego na-anọchịte anya naanị pasentị 14 mmadụ nọ n'ụwa azụtachaala ihe karịri ọkara (53%) ọgwụ mgbochi niile ndị nwereike ịdị ire."" Nke a gụnyere ma ọgwụ mgbochi Moderna niile nke 2021 na pasentị 96 nke Pfizer na-atụ anya ịrụpụta. Kanada bụ mbụ n'ime mba ndị a, dịka ngụkọ nnyocha ụlọọrụ Airfinity mere kwuru, ""ọgwụ mgbochi ha kwụrụ ụgwọ ya ga-ezu ịgba onye Kanada ọbụla ugboro ise"". A ga-enye ha ihe ha kwụrụ ụgwọ ya tupu a tụpụrụ mba ndị enwechaghị ego ọnụ. 'Achọla nnukwu uru' N'Afrịka, ọnọdụ a akpalitela ihe mere ebe afọ 1990, mgbe a rụpụtara ọgwụ e ji agwọ HIV/AIDS n'Amerịka. N'agbanyeghi na ọ bụ mpaghara a ka nwee ndị bu ọrịa HIV, o were ihe ruru afọ isii tupu ọgwụ e ji agwọtụ ọrịa ahụ enwee ike irute ndị Afrịka aka. Ihe ruru mmadụ nde iri na abụọ nwụrụ site n'ọrịa ahụ n'ime afọ iri, ebe ọnụọgụgụ ndị o gburu n'Amerịka belatara ọfụma, dịka nchọpụta ndị Africa Centers for Disease Control and Prevention si kwuo. Ngagharị na mkpu ndị mmadụ tigidere mere ka e nwee ike weta ọgwụ Aids na-adịghị oke ọnụ n'Afrịka Winnie Byanyima bụ onyeisi ngalaba UNAids nọ n'ihu ndị na-eti mkpu ka ndị na-emepụta ọgwụ Covid-19 mee ihe ziri ezi. ""Anyị anaghị ekwu ka ha ghara irite uru,"" ka ọ gwara BBC. Mgbe ọ bụ ọgwụ nke Aids, ọ bụ nsogbu ndị bu HIV na ndị bu ikike mmadụ nwere ịdị ndụ n'isi nọ na-enye mere ka ndị gọọmentị kwere ka a na-arụpụta ọgwụ ndị nke na-adịghị oke ọnụ. ""Ego ọgwụ Aids otu onye si n'ịbụ $10,000 n'otu afọ datuo na $100 kwa afọ."" Ọ chọrọ ka e sikwa etu ahụ mee maka ọgwụ mgbochi Covid-19, dịka ọ na-ekwu ka ndị ụlọọrụ mmepụta ọgwụ ""ghara ikwe ka akpịrị irite nnukwu uru na-akwagharị ha"". O kwuru na ha ga-eritenwukwa uru maọbụrụ na ha kesaa ihe ha mere ji nweta ọgwụ ha. 'Ịmafe ibe gị' Onyeisi ngalaba WHO kwuru sị ""Dịka a ka na-ekwu ka e mee ndị ọzọ ka e mere ibe ha, ụfọdụ mba na ụlọorụ ka na-achọkwa ụzọ ha ga-esi keta nke naanị onwe ha, nke mere ka ego ole a na-ere ya rịa elu, na-achọkwa ịmafe ibe ha kwụ n'ahịrị."" Saụt Afrika esonyela n'iji mmadụ ele ma ọgwụ mgbochi coronavirus dị iche iche ọ na-arụ ọrụ, mana ha enyewebeghi onye ọbụla ọgwụ mgbochi WHO na Vaccine Alliance mapụtara ebe Covax a ga-esi ekesa ọgwụ mgbochi COvid-19 na mpaghara ụwa. Ka ọ dị ugbua, ha azụpụtala ọgwụ ijeri abụọ maka mba ndị, nke gụnyere Afrịka niile. Ihe dị ka nde 600 bụ maka Afrịka. Ngalaba African Union ahaziela ka mba ndị nọ n'okpuru ha ga-etinye akwụkwọ ịnata $7bn n'aka ndị na-ebinye ego, nke ga-ekpuchi ọgwụ mgbochi nde 270 dịka Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka nakwa onyeisi ngalaba ahụ si kwuo. Ihe ndị ọzọ gbasara ọnọdụ coronavirus n'Afrịka: Naanị otu ọgwụ mgbochi ka WHO binyerela aka Mana ọ bụrụgodi na ha dị njikere, ihe gbasara mbinye aka ka bụkwa agada gbachiri ụzọ. A bịa n'okpuru Covax, naanị ọgwụ mgbochi nke WHO binyerela aka ka a ga-azụtanwu. Naanị Pfizer ka WHO kwuru na e nwereike ịzuta ma ọnọdụ gbatagbata dịrị. Mba ndị mepere emepe dịka Amerịka nakwa ụfọdụ dị na Yurop nwere ngalaba ndị na-akwado ọrụ WHO, nke ga-ekesanwu ọgwụ mgbochi na-echeghi WHO. Ọtụtụ mba ekesaala ọgwụ mgbochi ndị nke WHO ebinyebeghi aka. Dkt Mihigo kwuru ""ndụmọdụ anyị bụ ka mba ghara iche naanị ka WHO binye aka, mana ka ha werekwa mbinye aka ngalaba ndị ọzọ makwa ihe ha na-eme."" Mba ndị dịka Seychelles, Moroko na Ijipt na-enye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi nke ndị Chaịna rụpụtara bụ Sinopharm, ebe Guinea na-enye Sputnik V nke ndị Rọshịa. John Nkengasong bụ onyeisi CDC nke Afrịka kwuru na enweghi mkparịtaụka ọbụla a na-enwe maka ịzụta ọgwụ mgbochi abụọ a, mana na ngalaba ha na mba ndị na-arụpụta ha ""na-akpa"". Ọtụtụ mba ndị dị n'Afrịka na-etinyekwa uche n'ọgwụ mgbochi abụọ a, dịka ha ka na-eche ndị nke ndị ofesi ji agwọ nke ha. Mmụta Aids 'na-akuzighi' BBC ajụpụtanwughi n'ọnụ ndị ma maka ya mgbe ọgwụ mgbochi Covax nwereike irute ndị Afrịka aka. A ka na-ekwu na e nwere olileanya na o nwereike ịbụ ebe Febụwarị maọbụ ruo ngwụcha Maachị tupu nke Covax erute. Mr Schreiber nke Unicef kwuru ""Anyị chọrọ ibupu ọgwụ ndị nke mbụ a ga-ekesa ọsịsọ ọsịsọ"". A na-atụ anya na a ga-ebido ikesa ọgwụ nde 270 nke ngalaba African Union nwetara site n'ọnwa Epreelụ. E nwebeghi ọgwụ nke ndị WHO binyere aka a na-ekesa n'Afrịka ugbua. Byanyima kwuru na ""a mụtabeghi ihe e kwesịrị isi n'ọgwụgwọ HIV mụta ruo ugbua.""" afirika-49956833,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956833,'A wakpoola ụlọahịa m n'Aba',"Jane Ogbuata bụ onyeisi otu ụmụnwanyị a kpọrọ 'Women for Change Initiative', bụ ndị mere ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde, agwala BBC Igbo na awakporo ụlọakụ ya n'Aba n'ehihie Tọzde.","Content is not available End of Facebook post, 1 O buruụzọ gwa BBC Igbo na ndị otu ndọrọndọrọ PDP nakwa ndị gọọmentị Abia steeti na-eyizi ya egwu nke ukwu. Ọ gwara BBC Igbo na nke a malitere kamgbe ha mechara ngagharịiwe ahụ. O kwuru sị ""Kamgbe abalị abụo gara aga, ehibeghị m n'ụlo m."" ""E nwere ndị ji ụgboala ojii bia nọrọ n'ihu ọdụahia m n'Ikotekpene road, Ogbor hill, Aba."" Nke a na-abịa dịka Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi Abia steeti bụ John Okiyi kwuru na a kwụru ụmunwaanyị ndi ahụ mere ngagharịiwe ụgwọ. Mana Jane Ogbuata kwuru na ọnweghi onye kwụru ha ụgwọ ma ncha. O kwukwara na onweghị otu ọbụla ha na ha na-arụkọ ""Ihe kacha kpalie mmụọ m bụ mgbe onye otu anyi bi na Ngwa Road ime na-eme, mana maka ụzo ọjọọ, nwaanyị ahụ nwụru tupu a kpọga ya ụlọ ọgwụ."" Ndị otu 'Women for change initiative and Equity Organisation' Ogbuata kwuru na ""Gọọmentị rụo ụzo, ụmunwaanyi ahu ụzo gaa ahia, ụmụ anyị a gaa akwụkwọ, ndị mmadụ enwee ike bata Aba zụo ahia."" O kọwara na ọ bụ ikike ha n'ọchichi onyekwuoucheya ime ngagharị iwe. Jane Ogbuata kwuru na ha anaghi ezo onwe ha ezo. O kwuru na aha otu ha bụ 'Women for change initiative and Equity Organisation' na ha na-enwe nzụkọ ha na 'CS park'. Ọgbuata kowara na ha nwere uwe ha na-eyi dịka otu, kama mmadụ niile bụ ndị otu ha na-aga ahia azuta nke ya. Gịnị ka PDP kwuru? Mgbe BBC kpọtụụrụ onyeisi ndị PDP n'Ukwa East bụ Okechi Nwohu onye kwuru na ebubo na ndị PDP na eyi Jane Ogbuata bụ asi. O kwuru na ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu agaghi eme ihe dị etu ahụ. Abia steeti abụghị ọchịchị tigbuo zọgbuo nweghi Kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi ekwuokwala na 'Gọmenti Abia enweghi efe ịchụgharị onye ọbụla'. Ọ zị na Gọvanọ Okezie Ikpeazu enweghi efe tigbuo zọgbuo.""Ndị ahụ bụ ndị azụrụ azụ"" -John Okiyi, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia steeti kwuru Mana kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi gwara BBC Igbo na ụmụnwanyị ruru otu narị ndị mere ngagharịiwe bụ ụmunwaanyị ndị otu ọzọ kwụrụ ụgwọ ka ha mee ngagharịiwe megide Gọvanọ Ikpeazu. Mazi John Okiyi kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ọ kpọro 'Madam Jane' bidoro n'ịzụụka atọ gaara aga acho ụmunwanyi ọ ga akwụ ụgwọ ka ha soro ya mee ngagharịiwe. Onye sị na anyị anaghị akwụ ndị ọrụ ụgwọ n'Abia steeti tụrụ ashị O kwukwara na ọ ma ndị ha na madam Jane soro kpaa nkata a. Okeiyi kwuru maka ihe onyonyo gosiri ebe ụmụnwanyị a na-anara ego n'ihu ụlọ 'Madam Jane'. Kama mgbe BBC lere ya bụ ihe onyonyo, e gosighi ebe ụmụnwaanyị a na-anara ego. Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ha na-edebanye aha ha n'akwụkwọ. Mazị okiyi kwukwara na ụmụnwanyi ọzo ndị ruru narị atọ hụru nkata ọjọọ ndịa mere ngagharịiwe kpara wee pụta mee ngagharịiwe nke imegide ihe Mazi okiyi kpọrọ nkata imegide gọomentị gọvanọ Abia seeti. Maka iji ụgwọ Mazi John Okeiyi kwuru na onweghi onye na-arụrụ gọọmentị Abia steeti ọrụ e ji ụgwọ. O kwukwara na ọ bụghị gọọmentị Abia steeti ka ọ dịrị ịkwụ ndị Abia steeti Politeknịk (AbiaPoly) na ndị ụlọọgwu mmụta nke Mahadụm Abia steeti ụgwọ (ABSTH). Gee akụkọ ga-amasị gị" afirika-43417841,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43417841,Ndị na-achi ehi egbuola mmadụ 27 na Kogi,"Ndị ji egbe, a na-ebo na ha bụ ndị ochịehi, egbuola mmadụ iri abụọ na ise na Kogi steeti.","Ọtụtụ mmadụ awụọla na Benue na Kogi na-aka ndị ji egbe ha na-ebo na ha bụ ndị ọchịehi Ọ bụ obodo Oganienugwu, Ikende na Abejukolo n'ime Kogi ka mkpamkpa a mere. Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmmadụ na-agba ọsọ ndụ makana ha na-atụ egwu na ndị a jiri egbe ga-alaghachị azụ. Ugbu a ndị uwe ojii na ndị agha agaala ebe a ahụ ịme ka udo laghachịta. Ndị hụrụ ihe mere gwara ndị nta akụkọ na a jiri mma magburu ọtụtụ n'ime ha. Ha kwukwara na ndị a bidoro ogbugbu ha na ugbo tupu ha bata obodo n'ime abali. Onyeisi ndị uweojii bụ Monday Bala na steeti ahụ kwuru na ọmaghị mmadụ ole nwuru n'eziokwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53847149,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53847149,Ogbunigwe agha Biafra emerụọla ụmụaka abụọ ahụ n'obodo Eziorsu Ugwuta dị n'Imo steeti,Ogbunigwe a na-eche si n'oge agha Biafra agbaala ma merụọ ụmụnne abụọ ahụ n'obodo Eziorsu dị n'okpuruochịchị Ugwuta n'Imo steeti.,"A ka na-egbupute ogbunigwe n'ala Ọwụwa Anyanwụ Ụmụaka ihe a metụtara bụ Confidence Uzi dị afọ 16 na nwanne ya bụ Chinedu Uzi dị afọ 10. Otu onye okenye n'obodo ahụ aha bụ Chukwujekwu Charles Jeruo gwara BBC n'ekwentị na ụmụaka a na-eghe garị oge ihe a mere n'ubọchi Tuesday. Maazị Jeruo sị na ihe mere n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde nke bụ ubọchị 18 nke ọnwa Ọgọstụ. ""Ụmụaka a na-eghe garị mana ha amagị na ihe ha ji bụ ogbụnigwe. Ọ sị na ọ bụ ka igwe a natara ọkụ ka ọ gbara were merụọ ụmụaka a ezigbote ahụ."" Ọ sị na ọ metụtara na n'aka, n'ukwụ ma n'ihu. N'agbanyeghi na ụfọdụ akụkọ n'ekwu na otu n'ime ndị ihe a metụtara anwụọla, onye ya na BBC Igbo kwuru sị na ha abụọ ka dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ. Nna ụmụaka hau bụ Goddy Izu kọwakwara BBC etu o si mee nakwa ọnọdụ ụmụ ya ugbua. Ọ sị na igwe ahụ dị na be ya kemgbe, kama ha amaghị ihe ọ bụ. Ọ sị; ""egwupụtere m ya oge m na-arụ ebe a na-esi nri, mana anyị che na ọ bụ igwe. Makana igwe siri ike, anyị na-eji kari ya eti akị."" N'afọ 2019 BBC gara Eziorsu dịka ogbunigwe gbara ebe ahụ gbụrụ ụmụaka atọ na-achọ igwe ha ga-ere. N'oge ahụ, Igwe obodo ahụ gwara BBC na ọjọ ogbinigwe na-atụkari ndị be ha makana ndị agha nọsị ebe ahụ n'ike n'oge agha Naịjirịa na Biafra. Ọ si na nke bụ nkọwa ọtụtụ ogbunigwe a na-egwupụta na be ha." egwuregwu-43137722,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43137722,Champions League: Ka egwuregwu taa nwereike isi gaa,"Ka a na ahazi nkiri Man United na Sevilla na asọmpi taa nke ga-eme n'ama egwuregwu Ramón Sánchez Pizjuán dị na Spain, onye ọnu na erụ na okwu banyere egwuregwu bọọlụ bu Emeka Offor gwara BBC Igbo ka ihe nwere ike si kwụrụ.","Sevilla na-atụ anya na-etu ha si na-agba ọfụma ga enye ha mmeri taa Mazi Offor si na Man United bụ ndị ndị mmadụ na-atụ anya na ha ga-eme ọfuma n'asompi a, mana ha adighi eme ọfụma bọọlụ nke ha gbagoro na afọ di one n'one. Offor sikwara na Sevilla n'onwe ha chụrụ onye ndu ha bụ Eduardo Berizzona n'ọnwa Decemba nke afọ 2017. Sevilla chụrụ ya ka o si ụlọogwụ lota. Berizzona na aria ọrịa Kansa. Sevilla meriri anọ n'ime asọmpi ise ha sọrọ na mgbe na adịghị anya. Ha nwere ntukwasi obi n'onye ndu ọhụrụ ha bụ Vincenzo Montella, bụ onye gbara bọọlụ ka 'striker' na AC Milan, ga enye ha mmeri. Mana Sevilla ma na Man United bụ nnukwu mgbidi ha ga arịrị,. Offor gwara anyi. Man United bu nke nwere ike merie n'asọmpị a Ọ sikwa na Alexis Sánchez bu otu onye Man United Sevilla ga achọ ize taa, mana, Sevilla ga-eweta ezigbo ohere na asọmpị a ma Man United pụta inye goolu na egwuregwu a. Cheta na Leichester City meriri Man U na asọmpị ha sọrọ. Ihe a ga-eme ha ka ha kpachara anya obele. ""Man United ga bu ndị a ga-tu egwu kari a na asọmpị a, mana Sevilla nwere ike jiri 2:1 wee hazie asompị nke a ga-agba na Old Traford be ndị Man United,"" Offor gwara anyi. Ndị egwuregwu aga ele anya: Man United Alexis Sánchez Paul Pogba Romelu Lukaku Sevilla Wissam Ben Yedda Ever Banega Johannes Geis Asọmpị ọzọ a ga-ahazii taa bu Shakhtar Donetsk na AS Roma. Otu egwuregwu bọọlụ abụọ a atụghị anya na ha ga apụta na ọkara nke a na-akpo 'group stages' na asụsụ Bekee mgbe ahọpụtara etu a ga-eji gba asọmpị a, dika Offor kwuru. Cheta na Shakhtar Donetsk gbapụrụ Manchester City na okara mgbapụ nke Champions League na Decemba 2017 na asọmpị ahu tụrụ ndi mmadụ n'anya. Roma n'onwe ha gbapụrụ Chelsea ji gosi na ha zuru imeri ndị afa ha na-ada ụda. Mana mgbe Roma nọ na ọgbọ a ikpeazu bu kemgbe Totti ha ka na-agbarụ ha bọọlụ. Ike Roma na Shakhtar Donetsk dị ka ọdị nhatanha Mana, Offor si anyi na Roma na-abata asọmpị a ka ndị nwere ike merie. Shakhtar Donetsk n'onwe ha na-ahazighari na okpuru onye ndu ọhụrụ bụ Paulo Fonseca. Shakhtar na Roma wetara mmeri n'izu ụka gara aga. Asọmpị a dị ka ọ ga abụ nhantanha. Ọkpụ gọọlụ ha nwere ike ịbụ otu otu. Offor si na Edin Džeko nke Roma nwere ike inye goolu taa, ka Serhiy Hryn nke shakhtar nwere ike ịkpụ ọku taa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-43665489,https://www.bbc.com/igbo/media-43665489,Nwoke agbagbuola nwunye na nwa ha,"Ndị uweojii nwụchiri Peter Nielsen, maka echere na ọ bụ ya gburu nwunye bụ onye Naijiria na nwa ha n'ụlọ ha dị na Banana Island, Legos, ụbọchị Tọọsde.","Zainab nwetara ọrụ iguru otu ụlọọrụ egwu Asia a kpọrọ 'Petra Entertainment' n' afọ 2017 ebe o nwetara ụgbọala ọhụrụ, otu ụlọ na Banana Island na amara izisasi egwu ya n'ụlọ egwu ndị ọzọ n'Asịa maka nkesa na mba ụwa. Ụlọọrụ ndị ebe Zainab Ali-Nielsen,nke a mara dịka Alizee na-arụ e depụtara akwụkwọ gbasara ọnwụ ya na nwa ya. Ha rịorọ ngalaba na-ahụ maka mbịara mbịara ha dịrị njikere ma nye aka na-nyocha ọnwụ ndị ahụ Peter Nielsen jisike na-ekwu na aka ya kwụ ọtọ, na ọ bụ ebe ọ sị esị lọta ka ọ zuru ozu nwuye ya na nwa ya n'ebe obibi ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti, kwuru n'ezie na ihe mere ma kwukwa na a nwụchiela nwoke ahụ maka igbu ọchụ,maka ziga ndị nyocha na be ya. O kwuru na onye komishọna uweojii, Edgal Imohimi, enyela iwu ka anwụchie onyee eboro ebubo ma kpochie ya. ""Anyị amaghị ihe butere ọdachi ahụ. Anyị edela ndị embassy ha akwụkwọ ị gwa ha na anyị na-eche"" Dịka akwụkwọ akụkọ Punch siri kwuo, a dọnyela nne na nwa ya bụ Petra n'ụlọozu maka nyocha. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51680651,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51680651,Discrimination: Ị ma na ị nwereike ịkpa oke na-amaghị ama?,Ịkpa oke bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-akagbu ma sị na ọ jọgburu udele ma sigbuo nkapị.,"Mana, ị ma na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-akpa oke dị icheiche na-amaghị ama. Nke a na-akacha emebi ihe n'ihi na onye na-akpa ya bụ oke amaghị maọbụ ekweteghị na ọ na-akpa oke. Otu ihe dị mkpa ka ị mata bụ na ịkpa oke dị iche iche. Lee ụzọ ị nwereike isi na-akpa oke na-amaghị ama: 1: Ịma mmadụ maọbụ 'Nepotism' na Bekee Ị ga-enye enyi gị ọrụ ma ọ bụrụ na ọmaghị ya bụ ọrụ? 'Nepotism' pụtara mgbe onye nọ n'ọkwa ji ike ya wee nye nwanne ya ma ọ bụ enyi ya ọrụ ma ọ bụ ihe nrite ndị ọzọ nanị maka na ọ ma onye ọ bụ. Ị nwere ike sị na ọnweghị ihe ọ mere mana chetakwa na onye kwesiri ka enye ya ọrụ ahụ nọzị nkịtị. Ụzọ kacha mma i ji kwụsị 'nepotism' bụ ịhụ na onye ọbụla nwetara ihe ruuru ya, na-agbanyeghi onye ọ ma maọbụ ebe o si. 2: Enwetaghị ntaramahụhụ nke Bekee na-akpọ 'Impunity' Ndị nọ na nga Ụfọdụ mgbe ihunaanya anaghị ekwe ndị mmadụ inye ndị mmadụ nataramahụhụ ruru ha. Nke a ka a na-akpọ ""Impunity"" n'asụsụ bekee ebe ị nwere ike ịkpọ ya ""enwetaghị ntaramahuhu"" n'okwu igbo. Ụdị ihe a na-adịkarị ire n'ezinụlọ ebe nne ma ọ bụ nna anaghị ekwe ata ụmụ ha ahụhụ mgbe ha mere ihe ọjọọ maka na ha hụrụ ha n'anya. I ji gbochie ya, gbaa mbọ na-erube isi n'ihe iwu kwuru. Cheta na dịka ọchịchi na iwu obodo sịrị dị, ọ bụ iwu obodo kachasị di mkpa karịa ofufe dị iche iche. Nke a pụtara na otu ọ bụla osiri dị, ị ga-ajụ onwe gị, "" Gini ka iwu obodo kwuru maka nke a"". 3: Ịkpa oke agbụrụ nke Bekee na-akpọ 'Racism' Sterling nke Manchester City yị mgba aka edere ""Respect"" ị jị megide ịkpaoke agbụrụ Nke a bụ nsogbu so wee kpata agha mba ụwa nke abụọ bụ nke a kpọrọ 'World War Two' na Bekee. Ọ bụkwa ya butere nsogbu na mba Saụt Afrịka ọtụtụ afọ gara aga bụ nke a kpọrọ 'Apartheid'. Mana ruo taa, ịkpa oke agbụrụ ka na-enyekwa nsogbu n'akụkụ ụwa niile. Bido na mba Amerịka ruo Rọshịa, gaa Jamanị, bata Briten ọtụtụ ka na-akpa oke agbụrụ. Ikpa oke agbụrụ bụ nkwenye na otu agbụrụ ka nke ọzọ mma n'ụzọ ọbụla. Mana nke a abụghị eziokwu n'ihi na mmadụ niile bụ otu ma ndị ojii ma ndị ọcha. 4: Ịkpa oke obodo (Tribalism) Ikpa ọke obodo bụ mgbe mmadụ kwenyere na obodo ya ka obodo ndị ọzọ mma. Ọtụtụ ekwuola na nke a sọ na otu ihe na-enye obodo Naijirịa nsogbu. Oge ntụlịaka na Naijirịa, otụtụ mmadụ na-atụnyere onye nke ha maka na ha si otu obodo. Ọtụtụ ndị mmadụ ji maka ihe ha nụrụ maka obodo ndị ọzọ were too. Ọ dị mkpa ka mmadụ niile mara ma nabata obodo ndị ọzọ na asụsụ nakwa omenala ha, ma kuzikwaara ụmụ ha ime otu a. 5: Ịkpa oke ndị ọbịa nke Bekee na-akpọ 'Xenophobia' Ndị oke agbụrụ ọbia metụtara na Saut Afrịka Ebe nke a kacha pụta ihe nsonso a bụ na mba Saut Afrịka dịka ha sị ndị mbiarambia ka ha sị obodo ha pụọ. Ọ bụrụ na iwe na-ewe gị maka ndị ọbịa bi na obodo gị, lezie kwa anya na ị nwere ike ị na-akpa oke ndị ọbịa. Ihe nke a gosiri bụ na onwe gị ejughị gi afọ nke mere na ị kwenyere na ọ bụ ndị mbiarambia mere na ịtozughị etu ị kwesịrị. Ọ dị mkpa ka ịghọta na-enweghị onye gị na ya na-azọ obodo ma kwere na ị gbaa mbọ na ị ga-enwetakwa nke gị." afirika-53454650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53454650,Daniel Pondei o sila n'ụlọọgwụ pụta?,Ngalaba NDDC ewepụtala ozi na-akọwa nkoropu onye nọ dịka onyeisi ha bụ Daniel Pondei nwere mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ụbọchị Monde.,"Ha kwuru na ọrịa ahụ na-arịa ya kemgbe izu abụọ na-akawanye njọ kwa ụbọchị mana o nabataghị ndụmọdụ ndị dọkịta ya nyere ya maka ịgbahapụ ajụjụ akwadoro ịjụ ya. Ha kwuru na ọ chọrọ izara ọnụ ya nakwa debe aha ya ọcha nke mere o ji gawa n'ihu na nyocha ahụ. Pondei malitere ọrụ ịme ka onyeisi NDDC n'ọnwa Febuwarị nke afọ 2020 dịka ozi ahụ si kwuo. Nke a mere na ọ bụ ya ga-azara oku nyocha ọbụla a chọrọ ịme n'ebe ahụ. Daniel Pondei Etu Pondei si koropu mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị ụlọomeiwu na-ajụ ya Onyeisioche ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) bụ Daniel Pondei, onyeisi NDDC koropụrụ ka ndị omeiwu na-enyocha ya chara ya ọkụ Ka ọ dachara BBC ahụghị ndị ọrụ ọbụla gbatara ọsọ enyemaka mana ndị gbara ya okirikiri nyere aka kpọlite ya. Ihe ọzọ anyị hụrụ bụ na a kwụsiri nyocha ahụ ka a ga lebaa ahụike ya anya. Mgbe a jụkataziri Pondei ajụjụ, o kubitu n'oche ebe ọ nọ na-aza ajụjụ niile ahụ. Ajụjụ nke a jụrụ ya tupu ọ shọbuo bụ etu ngalaba NDDC ga-esi kwụ ụgwọ 'scholarship' ngalaba ahụ nyere ụfọdụ ụmụakwụkwọ ebe ọ bụ na ha emechiela bọjeti 2019 ebe edepụtere ya bụ ego dịka nke e mefugoro. Ndị ụlọomeiwu buru ụzọ gụpụta ebubo ndị ahụ site n'ọnụ onyeisi oche otu na-enyocha ngalaba ahụ maka amaghị mefu ego. Otu onye n'ime ndị ụlọomeiwu kwuru ka e were akwụkwọ ebe edepụtara ebubo a niile ma nye ya ndị nke bịara ịzaara ọnụ ha taa. Onye nọ n'ọnọdụ onyeisioche ngalaba NDDC bụ Kemebradikumo Pondei malitere gụpụtawa ego ha mefuru na ngalaba ahụ n'afọ 2020, mana ndị ụlọ omeiwu kwuru na ya wepụta akwụkwọ bọgeti ha ji hazie mmefu ego ahụ. Gịnị mere i ji nye ndị 'clear point' communication 641 million naira ? Pondei zara si na o nyere ha ego ahụ ka ha wee chọta ebe ndị NDDC na-arụgasi ọrụ ma jirikwa ya zụọ ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ. Covid-19 Pallative Pondei kwuru na ọ bụghị ijeri naira 1.5 ka ngalaba ahụ ji gboo mkpa covid-19 kama ọ bụ Ijeri naira 1.32 billion. Minista na-ahu maka Naịja Delta bụ Godswill Akpabio zara oku ụlọomeiwu nta kpọrọ ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara ebubo nrụrụaka Joi Nunieh boro ya. Cheta na ndị ụlọomeiwu kpọburu Pondei mana ọ gwara ha na onyeisioche otu ga-eme ngalaba ha nyocha nwere ebubo nrụrụaka nke mere na ọ gaghị aza oku ndị ụlọomeiwu kpọrọ ha. N'ụtụtụ taa bụ ụbọchị Julai iri abụọ ka ya bụ onyeisioche otu na-eme nyocha NDDC, Olubunmi Tunji-Ojo kwuru na ọ gaghị esonye na nyocha a maka ebubo mpụ a. Nke a mere ka amanye iwu ka ọ bịa, ma ọ sọrọ ya , ma ọ sọghị ya. Lee ka nkwupute a si aga n'elu soshal midia: Okwu 11 gbara ọkpụrụkpụ Joi Nunieh kwuru mgbe ọ gbara n'ihu ndị ụlọomeiwu nta Joi Nunieh bụbu onyeisi ngalaba Niger Delta Development Commission (NDDC) ji ihe onyonyo Zoom wụchie ebe ndị omeiwu Naịjirịa na-eme nyocha n'ụbọchị Fraịde maka etu esi gbarie ijeri kwa ijiri naịra e kwesịrị iji ruo ọrụ. Nunieh gwara ndị omeiwu na minista na-ahu maka Naịja Delta bụ Godswill Akpabio yiri ya egwu na ọ ga achụ ya n'ọrụ ma ya bụrụ na o kweghi iso ya ṅụọ iyi n'Uyo. Akpabio n'onwe ya agọọla na ya ekwughi ụdịrị ihe ahụ. Nunieh gwara ndị omeiwu na Akpabio sị na ọ bụ sọsọ ịṅụ iyi a ga-eme ka ha abụọ rụkọọ ọrụ n'ụdọ. O bụ gọvanọ Wike nke Rivas steeti bịara Joi Nunieh oge ndị uweojii bịara ịkpụrụ ya Ọkammụta Nunieh kpọkukwara ndị uweojii Naịjirịa ka ha nyocha Akpabio maka ebubo a makana ọ bụ ịda iwu Naijirịa ka ọ bụ ịmanye mmadụ ka ọ ṅụọ iyi. Ọ sị na Akpabio a kaara aga mkpọrọ ruo ọnwụ ya ma ọ bụrụ na ṅụrụ iyi a, mana dịka ọṅụghị ya ""ọ bụ afọ ise maọbụ asaa na-eche ya, dịka iwu Naịjirịa siri kwuo"". Ebubo Nunieh wụkwasara Akpabio na ndị ọzọ n'isi Ọkammụta Nunieh wụkwasara Akpabio ọtụtụ ebubo ndị ọzọ ka ọ na-aza azịza n'ọgbakọ nyocha ndị omeiwu a. Lee ụfọdụ ebubo na ihe ndị ọzọ dị ọkpụrụkpụ o kwuru: Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu ekwuola ka Godswill Akpabio bịa zara ọnụ ya n'ihu ha. Okwu ka nọ na ngịga. Ndị omeiwu asịla ka Sineto akpabio bịa zara ọnụ ya banyere ebubo Ọkammụta Nunieh boro ya Akụkọ ndị ga-masị gị:" afirika-43144355,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43144355,Ipob egosila iwe ha na-ebe Ikpeazu nọ,Ndi otu IPOB asaala Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu gbasra ihe o kwuru maka onye isi ha.,"Site n'akwukwọ ozi ọnu na-ekwuchitere ndi Ipob bụ Emma Powerful detara BBC Igbo, o kwuru na ndi mmadụ ga na-akatọ sị ihe gọvanọ IKpeazu kwuru maka Nnamdi Kanu. O makwara aka si Gọvano Ikpeazu na ndị Ugwu Hausa na-akwado ya depụta ihe niile ga-akwado ihe o kwuru maka onye isi ha,tumaadị na onye isi ha gbahapụrụ Gọvanọ ndi ọwụwa anyanwụ mgbe BBC Igbo service gbara ya ajụju ọnụ. N'ọnụ ya,""gwa ụwa ebe,mgbe ya na ndị ya so zụkọta Nnamdi Kanu. Anyi agaghị ekwe ka ọ gbanahụ asị ọtụru maka onye isi anyi"". Ọ sị na ihe ọbula Govanọ Ikpeazu kwuru gbasara onye isi ha emetutaghị ha makana ọ bụ cha asị. Okwu a pụtara na nkwado Ikpeazu na ndị gọvanọ ndị ala Igbo ndị ọzọ kwadoro ndị agha Naịjirịa mgbe ha mere njeghari ha kpọrọ ""Egwu Eke"" n'ala Igbo na afọ 2017. Ahụgbeghi Nnamdị Kanu kemgbe ndị otu ya si na ndi agha Naịjirịa wakporo be nna ya. Ndị agha Naịjirịa na-agọ na Kanu anọghi ha na-aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51401375,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51401375,Olaudah Equiano: Ndị Igbo anọ si na mmegbu ghọrọ ndị ọchịchị,"Mgbe ochie, mgbe a ka na-ere ndị mmadụ n'ohu, ọtụtụ ndị Igbo bụ ndị erepụrụ n'ohu.","Olaudah Equiano N'agbanyeghị na erepụrụ ha n'ohu, ha gosipụtara akọnauche Chineke jiri gọzie ha. Edemede a ga-egosi gị ụfọdụ ndi Igbo erepụru dịka ọhụ ma sitekwa n'ọhu, nwere onwe ha ma bụru mmadụ. ARCHIBALD JOHN MONTEITH Archibald Monteith bụ onye na-agbasa ozi nke Kraịst Monteith bụ onye e repụrụ n'ohu n'ihe dịka afọ 1802. Dịka akwụkwọ ụkọchukwu Joseph Horsfield Kummer dere maka Monteith na-ekwu, o kwuru na aha Igbo ya bụ Anaeso. Anaeso sị na ọ bụ onye 'Eboe' nke bụ etu ha si ede Igbo oge ahụ. O kwuru na nna ya lụrụ naanị otu nwaanyị n'agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnwoke na-alụ ụmụnwaanyị karịa otu oge ahụ. O kwuru na aha nne ya bụ Dirinejah, onye mụrụla nna ya ụmụ anọ nke bụ ụmụnwaanyị atọ na otu nwoke. Anaeso sị na ọ bụ 'Tschuku' ma ọ bụ 'Tschuku-damma' ka ha na-ekpere tupu atọrọ ya mgbe ọ dị afọ iri. Chukwu na Ikenga so n'ụfọdị chi ndị Igbo na-efe Anaeso sị na ọ bụ onye chọro ịlụ nwanne ya nwaanyị repụrụ ya n'ohu. Ihe ikpeazụ ọ gwara nwoke ahụ bụ ""Biko keleere m nna m ma gwakwa ya ebe m nọ"". Njem ya n'oke osimiri Ụgbọmmiri ka e ji ezupu ndị e jidere n'ohu Anaeso sị na ihe tụrụ ya n'anya bụ mgbe ọ hụru otu nwoke aka ya na ụkwụ ya nakwa ntutu isi ya na-acha ọcha. O kwuru na akpọbatara ha bụ ụmụaka n'ụlo onyeisi ụgbọmmiri ebe ndị okenye nọ n'okpuru ụgbọmmiri ahụ. Ọ kowakwara na ọ bụ ji na mmanya 'Rum' ka a na-enye ha, kama ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị iri nri ma o bụ ịṅụ mmanya maka obi adịghi ha mma. Etu ""Anaeso"" si bụrụ ""Toby"" Ọtụtụ ndị mba Ameríka nwere ohu mgbe ochie Ugbọmmiri bu Anaeso na ndị ohu ndị ọzọ buru ha gaa mba Jamaịka. Ọ bụ ebe a ka nna ya ukwu bụ Maazị Monteith zụtara ya n'ahịa ohu. Anaeso bụ nwata nwere 'ihuọma' dịka nna ya ukwu kpọbatara ya n'ime ụlọ ya ka o biri ma baa ya aha ọzọ; ""Toby"". Nna ya ukwu zigara ya ka ọ gụọ akwụkwọ, kama Anaeso sị na o nweghị uru ọhụrụ akwụkwọ bara mgbe ahụ. Mgbe nna ya ukwu nwụrụ, nwa ya nwoke ketara ya n'oke were mee ya onyeisi ihe niile o nwere. Mgbe o bidoro zawa Archibald Monteith David Monteith onye nna ochie ya bụ Anaeso, chọpụtara ebe nna ya ochie si. Anaeso sị na ọ kwụrụ onye ụkọchukwu shịlịn asatọ ka o mee ya mmiri nsọ. O kwuru na ihe o jiri mee ya bụ na o kwenyere na ọ ga-eme ka ọ gaa ebe mara mma mgbe ọ nwụrụ. Ihe ndị Jamaica ji mara Archibald Monteith Anaeso busoro ịgba ohu agha ma jiri izisa oziọma nke Kraịst megide ịgba ohu na mba Jamaịka. Anaeso sị na o nwere ala sara mbara nke ukwuu nke ọ gbatara na mbọ. Ọ mụtara otu nwa nwaanyị. Ihe gbasara mgbasa oziọma Kraịst na-anụ ya ọkụ n'obi. Olaudah Equiano (1745 - 1791) Olaudah Equiano Olaudah Equiano bụ nwa afọ Igbo nke erere ya na nwanne ya nwaanyị n'ohu. Equiano kọwara na ọ dị afọ iri na otu mgbe e rere ya n'ohu ma sịkwa na a mụrụ ya n'ihe dịka afọ 1745. O kwuru na ụgbọ ohu bu ha gawa 'West Indies'. E si ebe ahụ buga ya obodo Virginia ebe onyeisi ụgbọmmiri bụ Michael Henry Pascal zụtara ya. Ihe onyonyo na-egosi ka e si eme ndị ohu Ọ bụ nna ya ukwu bara ya 'Gustavus Vassa' nke bụ aha eze ochie ndị mba Swidin. Equiano mụtara etu e si agụ ma na-ede ihe, nke mere ka o dee akwụkwọ ya bụ 'The Interesting Narrative of the Life of Olaudah Equiano or Gustavas Vassa, The African.' Akwụkwọ ya kpataara ya nnukwu ego. Nna ya ukwu nke ikpeazụ bụ onye gwara ya na ya kwụọ ya paụnd iri anọ ka o nwere onwe ya. Equiano gbara mbọ were nweta ego a n'afọ atọ. O mechara bụrụ onye nke Kraịst n'afọ 1759. Equiano so na ndị gbara mbọ ịhụ na mba Briten kwụsịrị igba ohu site n'akwụkwọ o dere. N'afọ 1786 na Lọndọn ka Equiano sonyere n'otu a kpọrọ 'Sons of Afrika' ndị na-agba mbọ ịhụ na mba Briten kwụsịrị igba ohu. Equiano nwụrụ n'afọ 1797, ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ ya nwaanyị abụọ. Ahebi Ugbabe - Ezenwaanyị Igbo n'ọchịchị ndị ọcha Ugbabe lụrụ otutu ụmụnwaanyị ọkachasi ụmunwaanyị dị ha na emegide A mụrụ Ahebi Ugbabe n'obodo ụmụida nke dị n'Enugwu-Ezike. Nna ya bụ onye na-ete nkwụ ma na-akọkwa ugbo. Ugbabe si ala nna ya gbapụ dịka ndị obodo ha chọrọ ka ọ bụrụ ohu nye agbara nwaanyị ha na-efe. Ọ gbagara obodo Igala were bụrụ onye akwụnakwụna. Etu a ka o si mata Eze Igala na onye na-anọchite ndị mba Briten mgbe ahụ. Ọ mụtara etu esi asụ Bekee egbujiri egbuji, Nupe na Igala. Mgbe ndị Briten wakporo ndị Enugwu-Ezike ka ha mere ya eze n'ihi na o nwereike ịnụ asụsụ ndị Briten. Ugbabe mere ọtụtụ ihe ime ka ụmụnwaanyị nwee ikike n'ala Igbo mana ụfọdụ atụmatụ ndị a butere esemokwu. Ọ lụrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị ọkachasị ụmụnwaanyị ndị di ha na-emegide, nwa ọbụla ha mụrụ n'ụlọ ya na-aza aha Ugbabe. Ọ bụ ezie na Ugbabe abụghị ohu, kama o si na ihe mperi dị ukwu wee bụrụ eze n'ala Igbo. Jaja nke Opobo A mụrụ Jaja n'obodo ụmụduruoha, Amaigbo nke dị n'Imo steeti, n'afọ 1821. Mbanaso bụ aha Igbo ya, mana eji Jugbo Jugbo mara ya n'Opobo. Ndị ọcha enweghị ike ịkpọ Jugbo Jugbo nke mere ha ji kpọwa ya 'Jaja of Opobo'. E jidere Jaja dịka ọ na-egwu egwu were resi ya Eze Iganipughuma Alison nke Bonny. Jaja gbara mbọ n'ịzụ ahịa were nweta nnukwu akụnaụba. Jaja ji aka ya chọta ma bulie obodo Opobo Ike jaja mere ka onye Briten jiri kwuo na ọ bụrụ na egbughi jaja na o nweghị onye ya na Jaja ga-amanwu aka. Esemokwu mere ka Jaja gbapụ Bonny were nweta obodo nke ya ma nwekwa ndịagha siri ike. Ike Jaja mere na ndị mba Briten na-akpọtụrụ ya ma nata ya ikike tupu ha azụọ ahịa n'Opobo. Mgbe ndị Gana na-enye ndị Briten nsogbu, ọ bụ Jaja nyere ndị Briten aka merie ha. Ike Jaja na-akpa mere ka ndị Briten chọwa etu ha ga-esi napụ ya ike; ha mechara mee ka Jaja gaa biri n'ala ọzọ. Jaja hụkwara Ezenwaanyị Briten mana enweghị onye ma ihe ha abụọ kpara. Ndị be ya mechara mata na Jaja ka dị ndụ na mberede. King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12 Jaja nwụru dịka ọ na-alaghachi Opobo n'afọ 1891. Ka akụkọ si kwuo, e ji nsị gbuo ya n'ime ụgbọmmiri bu ya ala." egwuregwu-49651428,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49651428,Ukraine vs Nigeria: Naijirịa mechara bụrụ 'Aaron' gba aka.,Otu Super Eagles na ndị otu bọọlụ mba Yukrane mara onwe ha n'ụbọchị Tuzde.,"Ndị otu egwu bọlụ Naijirịa anaghị achị dịka ha jị goolu chara ọkụ were bido asọmpi enyi na enyi ha na Yukrane Ọ bụ na nkeji nke anọ ka Joe Aribo gosiri ihe o ji bụrụ dịke mgbe o nyere goolu a. Mgbe ọ dịka ndị Yukrane a chọrọ iteta n'ụra ka Victor Osimhen ji penalty were chụghachi ha azụ. Yukrane gbara lịkalịka mana Francis Uzoho ghọtara bọọlụ ha niile etu nwatakịrị si ata akara. N'ihe fọrọ nkeji atọ enyere tupu egbuchie agba nke mbụ, Yukrane emeghị pịm! Otu Yukrane ji iwe bata na agba nke abụọ ebe ndị Super Eagles tụrụ ute were naba ụra Oleksandr Zinchenko nyere goolu na nkeji 78 ebe Roman Yaremchuk nyere ọzọ na nkeji 79. Na ngwụcha, o doro anya nwoke na nwoke ibe ya ha bu eziokwu dika ha gbara onwe ha onye laba onye laba. Akụịko ga-amasị gị Ihe nkiri ga-amasi gi Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" 49686029,https://www.bbc.com/igbo/49686029,Onitsha Building Collapse: Gọọmenti nwere ụta maka ụlọ na-ada - Ọkacha mara n'ịrụ ụlọ,Onye ọkachamara n'irụ ụlọ bụ Njinịa Ikechukwu Ijiomah ekwuola na ụta dịịrị gọọmentị Anambara maka ụlọ dara n'Ọnịtsha n'ụbọchị Wenesdee.,"Onitsha Building Collapse: Gọọmenti nwere ụta maka ụlọ na-ada - Ọkacha mara n'ịrụ ụlọ Nke a na-abịa dịka ndị Kọmishọna na-ahụ maka ịrụ ụlọ nakwa nke na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ gọọrọ isi onwe ha na ya bụ ọdachi. Ijioma kwuru na ọtụtụ ihe nwereike ịme ka ụlọ daa, ọ nwere ike ị bụ na ọkpụisi amaghị akpụ maọbụ na agụba adịghị nkọ. Ọ kọwara na eleghị anya, ọ bụrụ na ala ebe a rụrụ ya bụ ụlọ esichaịghị ike. N'okwu ya: ""E kwesiri inyocha ihe ndị a niile tupu a mata ebe ya bụ mmiri sị baa n'opi ụgbọgụrụ."" ""Gọọmenti nwere ezigbo ụta maka ya bụ ụlọ na-ada maka na ọ bụ ọrụ ha ịnyocha ndị Njinia na-arụ ọrụ ụlọ tupu e nye ha ikike ịrụ ọrụ. Ikechukwu Ijeoma na-akọwa na otu ndị na-ahụ maka ịrụ ụlọ enweghị ụta maka ọtụtụ ụlọ na-ada n'ala Igbo. ""Gọọmenti kwesikwara inyocha ebe ọbụla a na-arụ ụlọ ịmata ma ebe ahụ ekwesiri ịrụ ụlọ."" Gee ihe ndị ọzọ okwuru n'ihe nkiri anyị. N'aka nke ọzọ, ndị kọmishọna BBC Igbo kpọtụụrụ enyeghị ezi ọsịsa maka ụlọ ahụ dara n'ogbe Nkisi Alori n'Ọnisha. Kọmishọna nke okwu gburugburu dị n'aka bụ Obi Nwankwọ gwara anyị na ọbụghị ụlọọrụ ya na-ahụ maka ụdị ihe ahụ. Mgbe anyị kpọtụụrụ Kọmịshọna na-ahụ maka iwu ụlọ bụ Mike Okonkwo, o kwuru na ọbụghị ya ga-aza ajụjụ ahụ. Matakwa na ọbụghị naanị ụlọ ahụ dị na nkịsị dara n'abalị Wenezdee. Mgbaaja ụlọmkpọrọ dịkwa n'Ọnisha dakwara n'otu abalị ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ John Abang gara jiri anya ya hu ka ya bụ ihe si mee. Ha sị na ọ bụ oke idemmiri so mmiri ozuzo kwaturu ya bụ ụlọ dị na Nkisi Alori. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44918803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44918803,SARS: Ndị uweojii achụọla ndị otu ha mmadụ anọ?,Osote onyeisi ndị uweojii nọ na Zoonu 2 dị n'Ikeja Legos bụ Adamu Ibrahim akwadola ka a chụlaa ndị uweojii SARS mmadụ anọ maka ebubo na ha zuru ohi nakwa mkpamkpa ndị ọzọ.,"End of Twitter post, 1 Otu onye uweojii welitere isi bụ Abayomi Shogunle depụtara ọchụchụ ha n'akara twitter ya. Shogunle dere aha ndị a chụụ dịka Sgt. Adeoye Adekunle, Sgt. Adekitan Adebowale, Sgt. Agbi Lucky na Sgt. Odighe Hehosa. End of Twitter post, 2 Mana onye nkwuchiteọnụ zoonu ahụ bụ Dolapo Badmus gwara ndị ntaakụkọ na a kpụpụkwara ha ụlọikpe maka iji egbe gaa ohi, ịtọrị mmadụ, ijide mmadụ n'ike nakwa imekpa ndị mmadụ ahụ nakwa iyi ndị mmadụ egwu. Badmus kwuruna otu kọmitii e kpokobara inyocha ihe ha mere bụ ndị kwuru ka a chụọ ha site na nyocha ha mere maka akwụkwọ ndị mmadụ dere megide ha. Ọ kọwara na ndị dere akwụkwọ ahụ bụ Chukwudi Godwin Odionye onye e ji aha 'Bishọp"" we mara ụbọchị Mee 2, 2018. N'okwu ya: ""Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru n'ụbọchị Juun 4, 2017, ọ nọ na be ya oge mmadụ anọ ji ege wụbatara be ya ịnwụchi ya na ọ na-ebu amụma ụgha na ihe ịrịbaama ụgha. ""Oge ha nwụchiri ya, a kpọrọ ya gaa n'otu ụlọoriri na nkwari ebe ha dobere ya ma yie ya egwu na a ga-egbu ya ma ọ bụrụ na o meghi ihe ha kwuru."" Ọ gara n'ihu kọwaa na ""Ụbọchị Juun 5, 2017, a kpọrọ ya gaa n'ụlọakụ ebe ha mere ha ka o tinyere ego ruru nde naịra asaa n'ụlọakụ otu n'ime ha. ""Oge anyị nwetara akwụkwọ ahụ, osote onyeisi ndị uweoji nyere iwu ka e lebaa ya anya."" Badmus kwuru na nyocha ahụ gosiri a onweghi usoro ziri ezi nke e soro iji nwụchi Chukwudi. ""Ndị SARS mmadụ anọ ahụ tọọrọ nwoke ahụ n'ụlọ ya ma jide ya megide iwu maka onwe ha"" dịka Badmus si kwuo. O kwuru na onyeisi ha enyela iwu na ha agaghị anabata agwa ọbụla na-ebuda aha ụlọọrụ ha maọbụ na-emchu ha ihu na mba ụwa. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nwụchi ahụ na twitter Adrian kwuru na a ka ga-ahapụ ha etu e kwuo na e jideburu otu onye bụ Festus nke e ji Ijaya mara mana ọ ka na-emekpa ndị mmadụ ahụ. Segalink kwuru na ntaramahụhụ ha kwesiri ịka mka na ọ bụ gọọmenti nyere ha egbe ha jiri zuo ohi. Timothy Atori kwuru na nke a kwesiri ikuziri ndị uweojii ndị ọzọ ezi ihe ma kwuo ka Chineke gọzie ndị uweojii Naịjirịa ma gọziekwa Naịjirịa. O teela aka a na-eti mkpu na twitter nakwa na ngwa soshal midia ndị ọzọ ka e kpochie ndị SARS site n'akara #EndSars. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45518367,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45518367,Hurricane Florence ka na-akpa mkpa mkpa na U.S.,"Ipob na ọkwa ịnọ n'ụlọ, kedụ ka ihe siri kwụrụ?","Enyimba, Aba nọ jụụ tata Oku Ipob kpọrọ maka icheta ndị otu ha lara mmụọ otumgbe a n'afọ gara aga dị ire n'Ọnịcha, Aba, Nnewi mana ọ kpụrụ afọ n'ala n'Enugwu na Ebonyi steeti dịka akụkọ kọrọ. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jụrụ eju bara abara n'ọtụtụ ebe n'alaigbo. Godwin Emefiele bụ Gọvanọ ụlọakụ etiti na Naịjirịa Gọvanọ ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele adọọla aka na ntị maka gbanụ gbanụ e ji abadọ atụmatụ iji otu ego na-azụ ahia n'ọdịda anyanwụ mba Afrịka. Onye nchịkọba West African Monetary Zone bụ Ngozi Egbuna sị na ndị mba ndị ọzọ enwetezụbeghị ihe a tụrụ anya n'aka ha. Ndị ọrụ ụlọmkpọrọ Briten dị 20,000 N'ofesi, ndị ọrụ ụlọ nga na mba Briten emela ngagharị iwe maka mmekpeahụ na mmegbu ndị mkpọrọ na-emeso ha. Mịnịsịta na-ahụ maka ọrụụlọ ndị nga bụ Rory Stewart sị na ya bụ abụbụ ọrụ ndị ọrụ ya gbara megidere iwu obodo ma kwekwa nkwa na a ga-etinye ọnụ na ya bụ okwụ ụbọchị Monday na-abịanụ. Amachiri Marcus Rashford asọmpị atọ dịka achụpụchara ya na asọmpi Man. U na Burnley Akụkọ kachasị n'ụtụtụ taa Na mba ofesi Ebirimmiri nke a kpọrọ Florence atụọla n'obodo North Carolina na mba Amerịka taa. Ndị mmadụ gbara ọsọndu nọ n'ọgbọ enyemaka dị icheiche ebe ihe rụrụ ụlọobibi otu puku narị enweghịzị ọkụ latrik. Na Naịjirịa, Egwu ji ndị mmadụ bi n'ọdịda anyanwụ ugbua maka ihe taa ga-apụta dịka ndị uweojii na-agagharị n'ihe ha kpọrọ ịgosi ike. Cheta na otu Ipob kpọrọ oku ka ndịgbo nọrọ n'ụlọ iji kwanyere ndị nwụrụ n'egwu eke afọ 2017 ugwu ruru ha. Ọzọ, Ndị mmadụ gụnyere gọvanọ chiburu Cross River bụ Donald Duke nakwa sinetọ Ben Murray Bruce akatọọla ọkwa onyeisiala nyere Yusuf Magaji Bichi dịka onyeisi ọhụrụ ndị DSS Mana nwa Bichi a kpọrọ Abba nọ na-ekele ya siite na akara Instagram ya. N'egwuregwu Ụmụ afọ Igbo ato esonyela na ndí nkuzi egwuregwu bọọlụ ga-aga emume ""World Remit future stars na London"" n'ọnwa oktoba Ha gụnyere Henry Iwuanyanwu, Ezindu Lawrence nakwa Felix Nwosu. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile Ihe onyonyo Kofi Annan" 44911968,https://www.bbc.com/igbo/44911968,Akụkọ kachasị n'abalị a: Atiku chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP n'afọ 2019,Isiokwu ndị dị mkpa n'abalị a: Atiku chọrọ ịbụ onyeisiala,"Atiku bụbụ osote oneyisiala oge Olusegun Obasanjo nọ n'ọchịchị Onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar, ekwuputala ebumnobi ya isonye na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. O kwuputara na ọ chọrọ ịzọ ọkwa a n'okpuru PDP n'ọgbakọ ndị otu PDP mere n'Adamawa bụ obodo ya taa. End of Twitter post, 1 Atiku gwara ọha na-eti aha ya na ọ ga-agba mbọ ịkwụsị ihe ịda oke ọnụ nke Bekee kpọrọ inflation, ma kwụsịkwa enweghị ọrụ dị na Naịjirịa. O kwukwara na Onyeisiala Buhari na ndị otu pati APC anaghị egosi ike ha n'ihe ndị kacha metụta ndị bi n'obodo. Alex Otti chọrọ ịbụ gọvanọ Alex Otti ekwuputala ebumnuche ya ịzọ ọkwa gọvanọ nke Abia steeti na ntuliaka afọ 2019. Otti kwuru na oge eruola ịzọpụta ndị Abịa n'ihe ọjọọ niile o kwuru na ha na-agabiga. O kwukwara na ndị otu PDP zunahụrụ ya mmeri o meriri na nke 2015. Na mba ofesi, Nwa ntakịrị dị naanị afọ anọ agbagbuola nwa dị afọ abụo ka o ji egbe mpa nnukwu ya na-egwu egwu n'obodo Muscoy dị na mba Amerịka. A nwụchiela mpa nnukwu ahụ, ebe a ga-ekpe ya ikpe maka ịhapụ egbe ya ebe aka nwantakịrị nwere ike iru. N'egwuregwu Bayern Munich gbara PSG ọkpụ atọ asatara otu taa ka ha zutere n'asọmpi International Champions Cup. Ọtụtụ ndị egwu PSG so gbaa asọmpi Iko Mbaụwa dịka Mbappe na Neymar esonyeghị n'egwuregwu nke taa. Ebe Borussia Dortmund ji otu ọkpụ merie Manchester City na ya bụ asọmpi. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Lee ụmụafọ Naijiria tọrọ na Rọshịa ka ha na-abanye ụgbọelu ịlọta Naijirịa Lee ụmụafọ Naijiria tọrọ na Rọshịa ka ha na-abanye ụgbọelu ịlọta Naijirịa" afirika-52128139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52128139,Coronavirus Tips: Ụzọ itoolu ị ga-esi gbalahụ isi nghasa n'ihi 'lockdown',Ọtụtụ ihe onyonyo na-egosi etu ndị mmadụ nakwa mba dị icheiche si aluso coronavirus ọgụ.,"Ịgbatị ahụ nke bekee kpọrọ 'exercise' so n'ụzọ i ga-eji jịkọọ onwe gị ọnụ n'oge a Dịka ndị mmadụ nọ n' ụlọ ugbua n'ihi mmachi gọọmentị machiri mkpagharị, ihe kachasị mkpa bụ ọdịmma uche na ụbụrụisi bụ nke Bekee kpọrọ 'mental health'. Ahamefula Agomoh bụ ọkammuta n'ihe gbasara ụbụrụisi na omume mmadụ (psychiatrist) kọwara na etu ihe siri dị ugbua, ihe kachasị mkpa bụ ịzọ ndụ. Agomoh kwuru na ọtụtụ ekwetebeghị na ọrịa coronavirus bụ eziokwu. O kwuru sị: ""Ndị mmadụ ekwetebeghi na coronavirus di."" ""Ụfọdụ che na ọ bụ asị gọọmenti na-atụ iji nwee ohere ime ihe ha chọrọ ime, bụ nke Bekee na-akpọ 'conspiracy theory'."" Ọ kọwara na ị gaa n'otutu ogbe, ndị mmadụ na-agagharị ma na-egwu egwu etu ọ si sọ ha maka na ha ekwetebeghi na coronavirus dị. Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus Agomoh kọwakwara na mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ ga-esita na-ekweghị ekwe baa n'iwe, n'ihi na ọ bụ kwa ụbọchị ka ọtụtụ na-akpata ihe ha na-eri. ""Ya atụla onye ọbụla n'anya ma ndị mmadụ mewe ngagharị iwe."" N'aka nke ọzọ, ọkachamara n'ihe gbasara ụzọ ibi ezi ndụ bụ Nnedimma Iwueke kọwara na ọ bụ ndị bi nanị ha, ndị ahụ na-esighị ike, ndị nweburu ọrịa ụbụrụisi nakwa ndị na-aṅụ ọgwụ ike maọbụ oke mmanya bụ ndị mmachi a ga-aka metụta ọnọdụ ahụike uche na ụbụrụ ha. Kedụ kwanu ụzọ mgbapụ? Ikiri ihe na-akpa ọchị na soshal midia ga-enye aka ka mmadụ chefụọ ụmụ ihe ụfọdụ Ndụmọdụ nke mbụ ha nyere bụ ka gọọmenti jiri ndị ha na ndị mmadụ na-emekọrịta oge ọbụla kuziere ha maka ọrịa coronavirus. Ha gụnyere onyeisi otu dịka 'National Union of Road Transport Workers (NURTW), ndị isi ndịahịa dị icheiche na ndị ọzọ. Ụzọ itoolu ị ga-esi gbanahụ isi nghasa n'oge mmachi a Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Covid -19 in 60 seconds: Yabas, jinja maọbụ galik o nwereike inye aka ịgwọta Coronavirus?" afirika-53765643,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53765643,Anambra steeti: Ihe mere gọọmentị Anambara ji kwụsị ndị eze 12 ọrụ nwa oge,Gọọmentị Anambara steeti akwụsịtụla ndị eze ọdịnala mmadụ iri na abụọ ọrụ otu afọ maka ime njem buuru gafee steeti ahụ na-anataghị ikike n'aka gọọmenti dịka iwu siri kwuo.,"Ndị nkwụsị ọrụ a metụtara gụnyere Igwe ndị Alor, Igwe Mark Anthony Okonkwo, nke Ezinifite bụ Igwe Chukwuma Bob Vincent Orji; nke Igbarịam bụ Igwe Nkeli Nelly na nke Mkpunando, Igwe Alex Edozieuno. N'akwụkwọ ozi nke Kọmịshọna na-ahụ maka ihe gbasara ndị eze nakwa ihe na-eme n'ime obodo bụ Greg Obi binyere aka, o kwuru na ""Gọvanọ enyela iwu ka anapụ ndị eze 12 akwụkwọ ikike ịbụ Igwe otu afọ bido n'abalị iri na otu ọnwa Ọgọstụ."" Obi kwukwara na anapụla ha ikike isonye n'ọgbakọ ndị ezeọdịnala na steeti ahụ ganye oge a ga-elebanyegharị anya na ya bụ okwu. Nke a na-eme dịka ọgbakọ jikọrọ ndị eze ọdịnala nwere nzukọ ebe ha kpebiri ma tụnye alo ka a taa ndị otu ha mmadụ 13 soro Arthur Eze gaa hụ onyeisiala Muhammadu Buhari na-anaghị ikike site n'aka Gọọmentị ahụhụ. Cheta na Gọvanọ Obiano kwụsiburu Igwe ndị Ukwulu bụ Igwe Peter Uyanwa, ọrụ dịka Igwe n'ihe metụtara mmekọrịta ya na Arthur Eze na-enwe nghọtahie. Igbo People: 'Ndị Igbo, ndị Bini na ndị Yoroba si otu ebe pụta' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44393952,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44393952,Mmadụ 15 anwụọla na 'mwakpo ndi ọchị ehi' na Benue steeti,"Ihe ruru mmadụ 15 nwụrụ na Benue steeti na mwakpo dị icheiche ndị omekome mere n'ime obodo Benue steeti, ka ndị gọọmentị steeti ahụ siri kwuo.","A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi wakporo ime obodo di icheiche n'ime abali abụọ, onye na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lawrence Onoja kwuru. A wakporo obodo Tse Ishav, nke dị nso na obodo Guma, na isi ụtụtụ Wenesde. Mmadụ asatọ nwụrụ ka a na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ ka ọtụtụ ndi ọzọ merụrụ ahụ. Mwakpo a mere ka abalị abụọ gara mgbe ndị oji egbe gbụrụ mmadụ abụọ n'etiti Yelwata. Aka na-achị ọchịchị obele obodo Guma bụ Anthony Shawon kwenyere na mwakpo a mere ma kwuo na mmadụ 10 nwụrụ tinyelu ụlọ na ugbo agala ọkụ. Ndị omekome mere mwakpo a gakwara n'ihu wakpo obodo Logo were gbuo mmadụ ise ma merụọ ndị ọzọ ahụ, Onoja kwụrụ. Ogbaghara dị n'etịtị ndị ọkọ ugbo na ndi ọchị ehi na Benue ebutela ogbugbu mmadu na mmebi akụnụba na ebe dịicheiche na steeti ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45268164,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45268164,Ọkaiwu Trump agbarala ya ọnya ogwu,Onye bụbu ọkaiwu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aha ya bụ Michael Cohen ekwetara na aka ya dị na mpụ emere mgbe ha na-azọ ọchịchị n'afọ 2016.,"Maazi Cohen kwuru mbu na ya nwereike nwuọrụ Trump, mana ugbua, onya ịgwe ka ọd oor o ya n'ụzọ Cohen gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ Onyeisiala Trump ziri ya ozi oji mee ya bụ mpụ banyere ịmetọ iwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị. Ihe Cohen kwuru na ya mere metụtara ụgwọ ọ kwụrụ otu nwaanyị na-eme ihe nkiri akwam iko. Cohen, bụ aka ikenga Trump tupu aka kpara ya, kwetara na aka ya dị na nrụrụaka dịkwa n'ịghọgbu ụlọakụ, na ụtụ obodo nke Bekee kpọrọ tax. Ụmụnwanyị abụọ a boro Trump ebubo na ọ kwara ha iko ma kwụọ ha ụgwọ ka ha mechie ọnụ Onye ọzọ rụrụ Trump ọru na nkwado ntuliaka nke 2016 ahụ aha ya bụ Paul Manafort gara n'ihu ọkaikpe ebe a mara ya ikpe ọnụ asatọ n'ime ebubo iri na asatọ e boro ya. Trump ekwughi ihe ọbụla maka Cohen, mana ọkatọrọ ikpe amara Manafort Ụfọdụ n'ime ikpe ndị a mara Manafort gụnyere akwụghị ụtụisi ka o si kwesi na iji aghụghọ zuo egọ ndị ụlọakụ. Cohen kwesiri ị ga mkpọrọ ruo afọ iri isii na ise mana arịrịọ ọ rịọrọ mgbe o kwuru eziokwu dị ya n'ọnụ ga-eme ka-enye ya afọ ise na ọnwa atọ." afirika-49361348,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49361348,Herdsmen Crisis: Anyị achọghịzị Fulanị ọchịehi na Mmaku - Ụmụokoroọbịa,Ụmụokorobia Agboneri Mmaku n'Enugwu steeti mere ngagharịiwe na mgbede Tọzde rute okporoụzọ awarawa si Enugwu gawa Pọtakọt.,"Obi adịghị ụmụokorobia Mmaku na-eme ngagharịiwe maka nọgbụgbụ mmadụ ha na-ebo ndị Fulani ọchịehi Ha sị n'iwe ha bụ maka ogbugbu mmadụ ha sịrị na ndị Fulani ọchịehi na-egbu n'obodo Mmaku nakwa okpuruọchịchị Awgu. BBC Igbo rutere n'ụzọ Agboneri Mmaku, ma hụrụ ụmụokoroọbịa karịrị otu narị ndị ji mma, osisi na anyike. Ha wee na-ekwupụta na oge eruola mgbe ha ga-achụpụ ndị Fulani niile na-achị ehi n'ebe ha. Ha ṅụrụ iyi na ha ga-emegwara ndị fụlani ọchịehi arụ niile ha kpara n'obodo ha ma ọ bụrụ na ha apụghị n'obodo ha. Kanu Nwankwo abụrụla onye ọrụ n'Imo Steeti Onye a ma ama n'ịgba bọọọlụ na Naịjirịa bụ Kanu Nwankwo anarala ọkwa dịka onye enyemaka pụrụiche n'egwuregwu nke Imo Steeti. Ọ gwara BBC na Tọzde na Gọvanọ Imo Steeti bụ Emeka Ihedioha nyere ọkwa a dịka onye enyemaka pụrụiche. Kanu Nwakwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m Onye enyemaka Ihedioha na mgbasa ozi bụ Izuchukwu Akwarandu n'ozi o wepụtara kwuru Nwankwo bịara iketa gọvanọ mgbe e nyere ya ọkwa a. Ihe mberede ụgbọelu na Rọshịa Ihe ruru mmadụ iri asaa na anọ merụrụ ahụ dịka otu ụgbọelu mba Rọshịa fedara n'ike mgbe o zutere ọtụtụ ụmụ nnụnụ n'elu. Ọtụtụ ndị sị na ọ bụ ihe ịrịbaama etu ụgbọelu a si fetuo n'akpọkasịghị. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48249142,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48249142,Electricity workers: Ha gbara abụbụ ọrụ n'Enugu nakwa steeti niile,Abụbọ ọrụ ndị TUC mere na steeti ndị ọzọ amịtaghị mkpụrụ dịka ndị ntaakụkọ BBC si chọpụta.,"Electricity workers: Ha gbara abụbụ ọrụ n'Enugu nakwa steeti niile N'ụlọọrụ TCN dị na Abuja, ndị ọrụ pụtara kwụsị ngagharịwe ndị ndị TUC na-eme ma kwuo na ha na-emebisiri ha ihe. Na Rivers steeti, onyeisi ndị TCN bụ Austin Jonah kwuru na ha nweteghị ozi ngagharịwe a n'oge mana ha ga-ebido ụbọchị Tusde na-abịanụ. Cheta na Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria bụ TUC nke Enugwu agbachiela ụlọ ọrụ n'enye ọkụ latrik bụ ""Transmission Company of Naijiria"" (TCN) n'aha ịchafụ. Ndị ọru bukakwụkwọ edepụtara iwe ha, wee na-agagharị n'gburugburu. Onye isi TUC Enugwu bụ Comrade Igbokwe Chukwuma Igbokwe du ndị ọrụ TCN were zọchịe n'ụlọ ọrụ ahụ ime ngagharị iwe maka mmegbu ha sịrị na onye isi kachasị ụlọ ọrụ ahụ na-emegbu ndị ọrụ. Ndị ọrụ ahụ ji iwe mechie ụzọ esi aba na ya bụ ụlọ ọrụ, buru akwụkwọ ha depụtara iwe ha ma na-agụ egwu ka obi dị ha. Igbokwe kwuru na GU Mohammed bụ onye isi ụlọ ọrụ ahụ na-ejị ndị ọrụ ụgwọ, na-enye ndị mmadụ akwụkwọ nkọwa ajọ agwa etu osiri masị ya. Ndị otu TUC depụtara mkpa ha chọrọ ka ndị isi ụlọọrụ TCN mere ha Ha kwukwara na o na-ebutu onye ọbụla gosiri iwe ya n'ọkwa na-eleghị anya n'azụ. Otu onye ụlọ ọrụ TCN so na-eme ngagharị iwe bụ Ogbonna Hillary kwara arịrị na onye isi ha bụ UG Mohammed ga alarịrị n'ọrụ n'ihi na ọchịchị ya bụ Eze onye agwalam. Ndị ọru bukakwụkwọ edepụtara iwe ha, wee na-agagharị n'gburugburu. Ogbonna kwuru na orubere ha niile bụ nke akwụsịrị ịkwụ ha n'ịhị na ha jụrụ ndị isi ajụjụ. Ndị ọrụ ahụ boro Mohammed ebubo na akụrụngwa latrik karịrị akpati puku asaa na ụma gọmenti tụlatata n'afọ gara aga bụ nke Mohammed agwaghị ha ka osiri gaa rue tata. Ode akwụkwọ ndị TUC Enugwu bụ Ben Asogwa kwukwara na ha agaghị ekwe ka mmadụ banye ma ọ bụ pụọ na ụlọ ọrụ ahụ tata ganye na gọmentị emere ha ebum n'obi ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51957556,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51957556,Coronavirus: A ga-agbachi ọdọụgbọelu Legọs na Abuja maka coronavirus,Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-agbachi ọdọụgbọelu dị na Legọs na Abuja malite na Mọnde abali iri na atọ nke ọnwa Maachị maka otu ọrịa a kpọ n'ọnụ bụ coronvirus.,"Onyeisi ụlọọrụ Nigerian Civil Aviation Authority bụ Musa Nuhu sị nke a bụ ịgbakwụnyere n'ọdọụgbọelu nke Enugwu, Pọtakọt na Kano e mechirila na mbụ. Ọ sị mmechi a ga-adị ruo ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprelụ. Kama na mfepu na mfebata ụgbọelu ndị dị ezigbote mkpa ga na-aga n'ihu n'oge mmechi a. Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ugbua eruola iri abụọ na abụọ Nke na-akpọtụ ugbua bụ na enwere ihe mberede okporoụzọ n'elụ akwa mmịrị nịaja ebe otu obere ụgbọla makpunyere n'okpuru gwongworo. Ndị uweojii na ndị Federal Road Safety nọ ebe ahụ ugbua ịmata ihe mere ya. Ọnweghị onye nwụrụ n'ime mmadụ isii ya bụ ihe metutara, mana mmadụ anọ n'ime ha meruru ahụdịka ndị ọrụ Road Safety si kwụọ. Mmadụ anọ ndị ahụ nọ na FMC Asaba anata ọkwụkwọ ka ọ dị ugbua. Road Safety sị na ọ bụ oke ịgbaọsọ n'aka onye obere ụgbụọla Toyota Celica bụ ihe mere o ji sọkanye isi n'okpuru gwongworo Mark ahụ. Ka o dị ugbua, ebupula ụgbọala abụọ ahụ n'ụzọ nke mere ụzọ ji aga were were. Onyeisi Federal Road safety n'Anambra steeti bụ Andrew Kumapayi na-arịọ ndị mmadụ ka ha benete aka n'oke ọsọ ma ghara ịgbafe oke asịrị ka aghara ịgba ọkachasị n'ebe dị kpachị kpachị. Mmadụ iri ọhụrụ ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa Mịnịsta ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehinare ekwupụtala na mmadụ iri ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa. Nke a mere ya mmadụ iri abụọ na abụọ buterela ya na Naịjirịa ugbua. Ọ sị na mmadụ 16 si na Legọs, 3 si na Abuja, 2 si n'Ogun steeti ebe 1 si n'Ekiti steeti. Ehinare gara n'ihu kwuo na mmadụ abụọ enwerela onwe ha ebe a na-elekọta ndị ọzọ anya n'ụlọọgwụ di iche iche ugbua. CBN ebuliela ego ana ere dọla Ụnụ anụrụ Ụlọakụ gọomentị etiti akụdaala ọnụego ana ere dọla. Ugbua, ya bụ ụlọakụ na-eresizia ụlọakụ ndị ọzọ narị naịra atọ na iri isii (N360) nke ji pasent iri na ise (15%) karịa ihe ana erebu ya na. Nke a ga-eme ka ndị ụlọakụ obere na ndi ahịa Bureau de change rewezie dọla otu ọnụego. Otiegwu na Kongo alaala mụọ Aurlus Mabélé ereela egwu karịri nde iri n'ọnụogu N'Afrịka, otuiegwu ama ama bụ Aurlus Mabélé anwụọla n'ụlọọgwụ dị na Paris, France. Kepu kepu na-ana anụ n'aka ndị na-eso ya na soshal media na-ekwu na ọ bụ Coronavirus gburu ya, mana BBC achọpụtabeghị nke ahụ ka ọ bụ eziokwu. Kenny Rogers alaala mụọ Ọzọ dịka ibe ya bụrụkwa na otuegwu ọzọ ama ama bụ Kenny Roger nwụọla ka ọ gbara afọ iri asatọ na otu. Onye ezi na ụlọ ya sị na ya bụ nwaamadị kụwara egwu kemgbe 1976 rahụru nwụọ ka ọ nakpuru. Nse na Waje no ọnọdụ nkwụcha maka coronavirus Enenewe ejeghị ọlụ na Naịjirịa bụ Ikpe-Etim na oti egwu Waje etinyele onwe ha n'ọnọdụ nkwụcha. Nse ikpe mere nke a kemgbe o si UK lọta , mana Waje mere nke ya makana ọ nụrụ na-ekwuru ka ndị niile gara AMVCA tinye onwe ha n'ọnọdụ ahụ. Ha gbara ama n'akara Instagram ya bụ ebe ọnọ kwụọ na ya mere nke a dịka ntuzịaka gọomenti sị kwuo maka ịgbochị ọrịa Covid-19. Ngagharị iwe n'Ọljirịa N'Afrịka,. ndị na-eme ngagharị iwe na mba Ọljirịa ejirile aka ha kagbuo ngagharị iwe nke izu a maka ọrịa Covid-19 Mmadụ iri n'ime iri itoolu ndị bu ọrịa a anwụọla na mba ahụ kemgbe ya bụ ọrịa malitere. Tokyo 2020 Oruola mgbe aga etinye ọnụ n'okwu ibugharị ụbọchị mmalite egwuregwu Tokyo 2020. Mbanụ, ọ bụ Nic Coward, onyeisioche egwuregwu dị iche iche n'UK na-akwado ya bụ emume sị na ọbaghị uru isiọnwụ na-aga eme ya bụ asọmpi ebe akagbuchagoro egwuregwu eji akwado ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 46257831,https://www.bbc.com/igbo/46257831,O nwere ihe ọhụrụ dị na nkwa next level Buhari kwere?,"Kemgbe onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara nkwa ọhụrụ oge mere ụmụ Naijiria ma ahọpụta ya ọzọ ka ọ chịa, okwu akpụ n'ọnụ bụ ""Next level.'","Nke a bụ aha ọ gụrụ akwụkwọ na-ekwuputa ebumnuche ya n'ebe ụmụ Naịiria nọ. I lezie anya nke ọma, ndịiche dị na nkwa 'Next level' na 'Change' bụ nkwa ya na pati ya bụ APC kwere ụmụ Naijiria n'afọ 2015 bụ na naanị aha ha. Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ ịgbanye mmanya ochie na ite mmanya ọhụrụ. Isi okwu nkwa abụọ ahụ gbadoro ụkwụ na inye ọrụ, ọkụ latrik, ibu agha megide nrụrụaka na okwu nchekwa. Na nkọwa ya, otu onye ọrụ na-eru n'okwu 'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Họn Chukwunonye Okereke gwara BBC na o nweghị ihe ọhụrụ dị na nkwa 'Next Level.' ""Ihe a dịka mmadụ iwepụta ihe e dere, ticha ya etum,wepụtara ndị Naijiria sịkwa ha gụọ."" Lee ụfọdụ ihe dị na nkwa 'Change' na 'Next level': Nkwa 2015 vs Nkwa 2019 N'ezie, ọtụtụ nkwa Buhari kwere na 2015, o mezughị ya. Iji maatụ n'ihe gbasara ọkụ latrik kama naanị megawat 7,000 ka ewepụtara n'ime 20,000 o kwere na nkwa. Kama inweta ọrụ, ihe karịrị nde mmadụ itolu bụ ndị a chụrụ n'ọrụ. Ọzọ bu nkwa ịrụ mahadum nka na ụzụ isii mana o rụbeghị ọbụladi otu. N'okwu Okereke, ihe Buhari na APC kwesiri ị na-agwa ndị Naijiria ugbua bụ ihe ha mere n'ime nkwa ha kweburu na abụghị ihe ha ga-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45854200,https://www.bbc.com/igbo/45854200,PDP: Imachi mmadụ 50 njem megidere ikike dịrị ha,Otu PDP ajụla mmachi gọọmenti etiti machiri ndị mmadụ ruru 50 ịpụ Naijiria ga njem mba ọzọ.,"Ụbọchị Satọde, gọọmenti etiti kwuru na ha na-amachi ndị ọnụ na-eru n'okwu ruru 50 ịga mba ọzọ dịka ha bidorola inyocha ha maka okwu gbasara mpu na aghụghọ. N'akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi nke pati ahụ bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP kwuru na 'iwu aka ike' ahụ megidere ọchịchị onyekwuucheya nakwa ikike onye ọbụla nwere ị ga ebe masịrị ya dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu Naijiria nke afọ 1999. PDP kwuru sị, ""Anyị na-ele anya na atụmatụ ịmachi ụfọdụ ịga mba abụghị iji kpugbuo ụfọdụ ndị nwere agba."" ""Ụwa niile ahụla ka ọchịchị nchịgbu siri eweghara ọchịchị onyekwuoucheya na etu ọchịchị Buhari siri jiri ụzọ agbasoghị iwu, na-enyopu onye ọbụla. ""A na-ejichi ngagharị nakwa mkpata ego na a gbasoghị iwu ọbụla."" Ha gara n'ihu kwuo na atụmatụ ahụ bụ iji megide otu PDP na ndị pati anọghị na gọọmenti n'ihi egwu PDP. N'okwu ha, PDP kwuru na mamịrị ọkụ n'awa gọọmenti etiti kemgbe Atiku meriri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati dịka ọṅụ juru ọtụtụ ndị mmadụ obi ka nke ahụ mere. Ha sịrị, "" he nke a pụtara bụ na ụmụ Naijiria ọkachasị ndị nọ na pati abụghị gọọmenti, ndị ji ego achụ ego na ndị e chiri echichi nọ na nnukwu nsogbu n'ihi na gọọmentị nwere ike ịkpa ike megide ha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-44798288,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44798288,Ala Igbo ebutela esemokwu n'etiti nwaanyị na nwoke,Juliet Kego Ume-Onyido bụ aha nwaanyị bidoro okwu a n'elu akara twita ya. Akụkọ a adọtala ndị abụghị ndị Naịjirịa n'ime ya.,"Kedụ ndị ga-erite akụ nwoke ma ọ nwụọ? O kwuru sị ""dịka m bụ nwaanyị n'ala Igbo, enweghi m ike ị nwe ala ebe ọ bụla n'ala Igbo n'enweghi enyemaka nwoke n'ezinaụlọ m"" End of Twitter post, 1 Etu ndị mmadụ siri saa okwu a gosiri na ọ bụ ihe dị n'uche ndị mmadụ mgbe niile. Otu onye bu @Nekem kọwara ahụmihe ya mgbe erere ala nna ya nwụrụ anwụ. @NnaEnibe kwuru na ihe na-ebute nke a bụ di a na-eche na nwaanyị kwesiri ị lụ. @mykel_rechard na-akọwa na ọ bụ omenala adabaghị adaba na ebute nhatanha nke a. Ọ bụghị kwa mmadụ niile kwenyere na okwu a dịka @aikmamah siri kwuo n'uche ya. @aikmamah kwuru na ọ dịghị mma ị kwu na ọ bụ ebe niile n'ala Igbo ka nke a na-eme. Onye ọzọ ekweneyeghị na okwu a bụ @Obedng, ọ sị na kemgbe oge gboo nwaanyị n'ala Igbo nwere ikike ị zụ ma rekwa ala. @Ezbaronkings kwuru na ọ bụ sọsọ ejighị ego bụ ihe ga-akwụsị onye ọbụla ma nwaanyị ma nwoke ị nwe ala. Cheta na ụlọịkpe kachasị n'ala Naịjirịa manyere iwu n'afọ 2016 ka ụmụnwaanyị nwee ikikere ị rite ala na akụnaụba ndịọzọ n'aka nna ha. Ị chere na iwu a ga-ekwe omume? Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51655773,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51655773,Physiotherapy: Onye nwere nkwarụ na-agba ọkpụkpụ,Remigius Anaiagbaoso bụ onye nwere nkwaru na nwata site n'ọgwụ agbara ya.,"Ihe kacha ewute ya abụghị nkwarụ ọ nwere site na ya bụ ogwụ agbara ya, ka ọ bụ mkpu ndị ọzọ na-eti mgbe nwaanye ya nwaanyị na-agba ha ọkpụkpụ. Nke a mere Remigius jiri gaa mahadum ga mụta ka esi agba ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ Physiotherapy. Kemgbe ahụ Remigius meghere ụlọọrụ ebe ọ na-agba ndị mmadụ ọkpụkpụ ma nwekwa ezi na ụlọ bụ ndị ọ na-elọkata anya. Ndị mere akụkọ a bu Chris Okereke na Chiemela Mgbeahụrụ" afirika-45756095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45756095,UBEC: Ụmụakwụkwọ na-anọghị n'ụlọakwụkwọ eruola nde 13.3,Ngalaba na-ahụ maka ikwado agụmakwụkwọ Praịmarị na secọndịrị bụ UBEC ekwuola na ọnụgụgụ ụmụaka Naịjirịa hapụrụ agụmaakwụkwọ esila na nde 10.5 gbagoo nde 13.2.,"Ndị ugwụ Awụsa kachasị nwe ụmụaka anaghị aga akwụkwọ na Naịjirịa Onyeisi ngalaba ahụ bụ Hammid Bobboyi kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọọsde oge ya na otu mbaụwa na-ahụ maka ụmụaka bụ Unicef zukọtara. ""Afo ole na ole gara aga, nsogbu Boko Haram dagidere Naịjirịa ma mee ka ọtụtụ ụmụaka pụta n'ụlọakwụkwọ ha dị na mpaghara ahụ. Bobboyi onye kwuru nke a site n'ọnụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ịkpalite mụọ ọha na ụlọrụ UBEC bụ Bello Kaigama sịrị : ""Ọ bụrụ na ịgbakọọ ụmụaka ndị gbara ọsọ ndụ na ndị a na-amụ ugbua, ị hụ na ngụkọ ahụike (demographic health survey) nke Unicef mere n'afọ 2015 gosiri na ụmụaka anọghị n'ụlọakwụkwọ eruola nde 13.2."" Ụnicef ndị kwuru na ọtụtụ ụmụaka ndị a nọ na mpaghara ugwu rụtụtụ aka na ha na-agba mbọ ka ha na ndị eze 200 nakwa steeti 19 kparịta ụka etu ha ga-esi gbo ya bụ ọgụ agụghị akwụkwọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48026241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48026241,Child malaria vaccine: A ga-enyocha ọgwụ mgbochi ịba na Malawi,Nnukwu nyocha ọgwu mgbochi mbụ maka ọrịa ịba amalitela na Malawi.,"Anwaala ọgwụ mgbochi mbụ ma na ọ bu n'obere obere Ọgwụ mgbochi a akpọrọ 'RTS,S vaccine' na-akụziri ihe na-alụrụ ahụ mmadụ ọgụ etu ha ga-esi awakpo ịba, bụ ihe anwụnta na-ebunye mmadu ma ọ taa ya. Na mbụ, obere ịgba ọgwụ mgbochi a gosiri na ihe ruru pasentị 40 n'ime ụmụaka dị ọnwa 5 ruo 17 nwetere ọgwụ a nwere mgbochi. Ọrịa ịba dịka ọ na-arị ọzọ na ka o mechara afọ iri enwetere mmeri n'iluso ya ọgụ. Dịka ọnụọgụgụ kwa afọ si ụwa niile na-akọwa na ọrịa a na-arigo arigo kama ịda ada, nke butere egwu na o jikwa ike alaghachite. 435,000 died of malaria worldwide 219m infectedAfrica saw more than 90% of cases and deaths Malawi bụ mbụ n'ime mba atọ a họpụtara iso na mgbochi mbụ a e ji ewepụta ọgwụ a. Ọ ga-enye ụmụaka puku narị iri abụọ dị afọ abụọ gbadawa mgbochi. Mba ndị ọzọ bụ Ghana na Kenya ga-amalite nke ya n'izu ụka na-abịa. Kedụ etu nsogbu ọrịa ịba dị? Ọrịa ịba na-egbu ihe ka mmadụ 435,000 n'ụwa niile kwa afọ, ọkachasị ụmụaka. Ndị ọrịa a na-egbu karịrị n'Afịrịka, ebe ihe karịrị ụmụaka 250,000 na-anwụ kwa afọ, dịka WHO si kwuo. E bidoro ịnwa ọgwụ a n'afọ 2009. ""E nwere mba asaa so nwaa ihe a ụmụaka 15,000 so mee,"" Dọkịnta David Schellenberg gwara BBC Newsday. Ọ sị; ""Nwale a gosiri na ọgwụ mgbochi a na-egbochi ịba. Onweghị ihe ọjọọ ọbụla ọ na-eme."" A họtara mba ndị a makana ha na-eme nnukwu mgbochi ịba, nke gunyere iji 'net', ma nwekwa ọtụtu ndị bu ọrịa ịba. Oteela ndị mmadụ na-eti mkpu ka ewepụta ọgwụ ga-agwọ ịba Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50941369,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50941369,New Year's Day: Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’,"Ka a na-abanye afọ iri ọhụrụ nakwa agba ọhụrụ ọzọ, ọtụtụ ihe agbanweela nke bụ na ụfọdụ ndị a mụrụ n'otu oge agaghị amata ihe ha bụ.","Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị dịbu adị mana ụmụaka a mụrụ n'oge Bekee kpọrọ 'Generation Z' (site n'afọ 1999 ruo ugbua), amaghị ya dịka etu a ọ dịbu. Ha mazị ya ugbua site n'ụzọ ọgbara ọhụrụ e si rụgharịa ya, nke bụ na ihe ndị ahụ adịla mfe iji n'aka na-akpagharị ma ị chọọ. Lee ụfọdụ ihe ndị ga-agba ụmụaka 'Generation Z' gharịị: Kaseetị 'Cassette player': Ụmụaka 'ọgbara ọhụrụ' amaghị mgbe a na-ebu redio ebu kama ịkpa ya n'aka. N'ihe karịrị afọ iri gara aga, a na-etinye ihe a kpọrọ 'kaseetị' n'ime igwe okwu na-enwekarị ma redio ma ihe na-akpọ ya bụ kaseetị, tupu ị gere egwu. Mana ugbua, e nweela ihe dị ka 'YouTube', Audio Mack, Spotify, Boom Play na ihe ndị bụ ebe ị ga-esi butuo egwu ọbụla masịrị gị, tinye ya n'ekwentị gị maka igere ya oge ọbụla ị chọrọ. Ọ bụrụkwanụ na ị chọghị ibutu ya ebutu, ị nwereike lere ya ka vidio n'elu ịntanetị mgbe ọbụla ị chọrọ. Ka ọ dị ugbua, ekwentị niile a na-arụpụta ugbua na-ebu redio n'ime ya; nke ọ ga-abụ ịkwụnye ihe ntị ya nke bekee kpọrọ 'earphone', ọ bụrụzịa gere gawa. Ekwentị: Mgbe ahụ ọ bụ ekwentị a na-ewu, o nwereike ịbụ naanị otu onye maọbụ abụọ nwere ya n'agbataobi, ndị ọzọ a na-abịa aza oku ebe ahụ. Ọ bụrụ na ị ma mgbe a na-eji ekwentị a akpọ mmadụ, e kwesịrị ka a na-akpọ gị 'daa' maọbụ 'dee'. Makana ọ gafeela afọ iri abụọ (20) e wepụtara nke a na-ejizi n'aka nke bekee kpọrọ 'mobile phone'. Ndị ma ekwentị a ma ihe ha ji anya ha hụ gbasara ịkpọ mmadụ. Ọ pụtara na onye ahụ ga-anọgodu nso ya bụ ekwentị tupu ọ zaa ya. Mana ugbua, ọ bụghị naanị na ị ga-anọnwu ebe ọbụla zaa ekwentị gị ma mmadụ kpọọ gị, ị ga-ejinwu ekwentị gị nweta ozi maọbụ chọta ozi site n'ihe a kpọrọ 'ịntanetị'. Ihe e ji emepe komkom Ụfọdụ na-echigide komkom ha n'ala tupu e chipuo isi ya, kama iji ihe e ji emepe komkom mgbe ochie N'agbanyeghi na ụfọdụ ka na-eji mma emepe komkom, e nwere ihe a rụpụtara iche a n-eji emepe ya. Ihe ahụ nke bekee kpọrọ 'tin cutter', bụ ihe a na-eji agba komkom okirikiri. Tupu afọ 2000 eruo, a na-eji nke ọ ga-abụ ị sụnye n'ime komkom ị were aka gị na-akụ n'elu ya, megide etu a wee gazuo okirikiri okwuchi komkom ahụ. Mana ugbua, egwu adagharịala makana ndị nke a na-arụpụta ugbua anaghị ata ndụ mmadụ ahụhụ. Akwụkwọ ozi ịhụnanya (Love letter): Ndị agba ọhụrụ a ka ma na a na-ede leta ugbua? Mgbe ochie bụ na ị ga-ede akwụkwọ ozi, nye mmadụ ka o nye onye i deere ya, maọbụ gaa n'ụlọorụ nzipu ozi a kpọrọ 'post office' ịga zipu ya. Mana ụbọchị agbanweela ugbua, kama ogologo usoro ahụ, ị ga-edenwuzi ihe bekee kpọrọ 'text message' n'elu ekwentị gị, zipu ya na-erughi otu nkeji, onye ahụ asakwaa gị ozugbo. Nke ugbua bụ na ị nwere ike zie onye ị chọrọ izi ozi, ihu na ihu site na nke a kpọrọ 'video call'. Owu e ji akpa isi: Ụmụaka ọgbara ọhụrụ nwereike ha ahụtubeghidị owu isi a anya mbụ makana a na-achọzị ya achọ n'ahịa. Mana oge ọ na-ewu, ihe a bụ ihe e ji eke isi dị iche iche, na-achọ mma n'ụzọ pụrụ iche. Akụkọ kwukwara na ọ na-enye aka ime ka ntutu mmadụ too ogologo. Ugbua, kama iji isi owu kee isi, e nweela nke a na-akpọ 'attachment', 'weaveon' nakwa ndị ọzọ dị iche iche a na-eji eke isi. 'Typewriter' Ọ bụrụ na ị ji taịpraịta gụọ akwụkwọ maọbụ rụọ ọrụ, ekelekwaa m gị oo! Kọmputa pụtara ụwa napụzịa taịpraịta ọrụ ọ na-arụ bụ iji ya ebi ihe n'akwụkwọ. Ugbua, kama ọ ga-abụ i jiri taịpraịta na-ede ihe ị gbaa mbọ hụ na i tinyere 'ịnk', na ị kwagharịkwara ya ma ị degide ruo n'isi dgz, ị ga-edenwuzi ihe niile ị chọrọ n'elu kọmputa gị, na-atụfughi ụra n'ebe ị ga-esi weta ịnk makana ọ gwụlahịri gị. Kọmputa emeela ya ka ọ dị mfe ide ihe na mpempe akwụkwọ. Kedụ ndị ọzọ ị ma? Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: 2019 in summary: Were anya gị gba nkiri" afirika-50376180,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50376180,Tam David-West anwụọla n'afọ 83,Onye bụbu Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Tam David-West anwụọla n'afọ 83.,"Onyeisiala Mụhammadu Buhari riri uju maka ọnwụ Maazị David-West rụrụ ọrụ n'okpuru ya n'akara Twitter ya. End of Twitter post, 1 Maazị David-West bụbu onye ọkammụta n'ihe banyere nje ma rụọ ọrụ dịka Minista site n'afọ 1983 ruo 1985 mgbe a chuturu Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala. Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka ọnatara chị, ọkụ nakwa igwe n'oge ọchịagha Ibrahim Babangida. Ka Buhari malitere njem ị bụ onyeisiala ọzọ n'afọ 2015, David-West so na ndị kwenyere na ya nke ọma. Ọ gwara BBC mgbe ahụ na Buhari ga-eme ọfụma, ọkachasị n'ebe o si metụta mmanụ agbịdị site n'ihazigharị ngalaba ahụ ma rụzie ụlọọrụ mmepụta mmanụ Bekee kpọrọ ""refinery"". Naịjirịa amalitela ihiwe ebe a na-arụ ụgbọ oloko Gọọmentị etiti amalitela ịrụ ụlọọrụ ebe a na-emepụta akụrụngwa ụgbọ oloko na Kajola dị n'Ogun Steeti. Ọ bụ osote onyeisiala bụ Yemi Osinbanjo hiwere ntọala e ji arụ ụlọọrụ a n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba. Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi sị na ụlọọrụ a dị n'okporoụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ga-abụ nke mbụ na Naịjirịa. Ọ sị na a ga-eji ya arụpụta akụrụngwa ụgbọ oloko dị iche iche eji arụ ọrụ na Naịjirịa nakwa na mba ndị ọzọ. Ọ sị na ọ bụ ụlọọrụ China Civil Engineering Construction Corporation (CCECC) na-arụ ya site na nkwekọrịta ha na mịnịstrị ụgbọala nwere n'afọ 2018. Ụlọọrụ CCECC sị na ha ga-arụpụta ụgbọ oloko dị narị ise n'ime otu afọ.. Osote onyeisiala Osinbanjo sị na ijikọta ọdụ ụgbọmmiri na nke ụgbọ oloko ga-eme ka azụmaahịa na Naịjirịa nakwa Afrịka mụbaa. N'ofesi Oke ọgbaghaara dị na mba Bolivia maka arụkwaghịm n'ọrụ onyeisiala ha bụ Evo Morales gbara n'ihi ngagharịiwe ha mere ọtụtụ izuụka megide maka ntuliaka ọjọọ. Morales rituru n'ọkwa ngwangwa onyeisi ndịagha ha pụtara n'ọha sị ya hapụ ọkwa ya. N'egwuregwu Onweghi ntaramahụhụ a ga-enye onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola maka agwa ọ kpara mgbe Liverpool meriri ha n'asọmpị ụnyaahụ. Mgbe a jụrụ Guardiola, ọ sị na o nweghi ihe ọjọọ o mere karịa 'Daalụ nke ukwuu' ọ sịrị onye ogbu opi bọọlụ Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Ndị Ghana agbachiela ụlọ ahịa ndị Naịjirịa ọzọ" afirika-50542907,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50542907,IPPIS Registeration: Ihe mere anyị achọghị iso n'atụmatụ IPPIS - ASUU,Ọ bụghịzi akụkọ na gọọmentị etiti na otu jikọtara ndị nkuzi mahaduma na Naịjirịa anaghị esi otu ụzọ aga n'okwu banyere ụfọdụ ihe.,"Otu n'ime okwu ndị ahụ bụ nke a kpọrọ 'Integrated Payroll and Personnel Information' bụ usoro e ji edebanye aha maka ịkwụ ụgwọ ọnwụ. Gọọmentị etiti chọrọ ka ndị nkuzi mahadum malite soro n'atụmatụ a n'ụbọchị 25 Nọvemba, 2019 mana ha kpọrọ ekwe nkụ sị ọ gaghị adị ha mma n'ahụ. Onyeisi otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ ọkankuzi Biodun Ogunyemi gwara BBC Igbo sị o megidere ikike mnwereonwe ndị mahadum na Naịjirịa n'ụzọ ndị a; Ogunyemi sị na ha eburula okwu a gaa n'ụlọomeiwu bụ ndị kwere nkwa na ha ga-elebanya n'ime ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmentị chọrọ ihiwe ụdị atụmatụ a, ka ha nye mahadum dị iche iche ime nke n'ime ụlọ ha. Na ọ bụ ụdị atụmatụ a ka ha gwara ndị ụlọomeiwu bụ nke ha sịrị ha gaa leba ya anya. Ogunyemi dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha ghara itinye aka n'atụmatụ IPPIS ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53859738,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53859738,"Ka oge e nyere ha gara, ndị Naijirịa tọrọ na Dubai na-arịọzi ka agbatara ha ọsọ enyemaka",Ndị Naịjirịa bi Dubai agwara BBC na ọkankụ ndị be ha tọrọ na mba ahụ na-arahụ n'ezi dịka ha ahụghị ebe ha ga-abanye.,"Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ịfegharị na soshal midia banyere ọnọdụ ndị a. 'Ọtụtụ ndị Naijirịa enweghịzị ebe obibi' Maazị Ifeanyi Ibe bụ onye Naịjirịa bi mba UAE kwuru na ọnọdụ ụfọdụ ndị Naijirịa bị n'ebe ahụ ugbu a adịghị mma. Ọ kọwara sị ""ọ bụ ndị akwụkwọ obibi ha emebiela maọbụ ndị na-enweghịzi ọrụ kacha ata ahụhụ"". Ngalaba odoziakụ Dabiri-Erewa nọ n'isi akpọlatala puku kwa puku ndị Naịjirịa tọrọ n'ofesi maka mkpa mkpa covid-19 Maazị Ibe kọwakwara na ụfọdụ ndị biara njem nlegharị anya mgbe mmachị ọrịa coronavirus bidoro sokwa na ndị a tọro atọ. O kwukwara na mba Dubai nyere ohere nke ha jiri kpọọla ndị Naijirịa ma kwụọrọ ha ụgwọ ụgbọelu buletara ha na-efu. Ibe mekwara ka anyị ghọta na n'izuụka abụọ ọ gara mpaghara ụlọ nnọchịte anya Naijirịa na mba ahụ na ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ọgịge ụlọ ahụ achọ enyemaka gọọmentị ndị Naijirịa. O kwuru na ọ bụ ndị mba Dubai na-enye ha mmiri na obere achịcha ha ji eleta onwe ha anya. 'Ụfọdụ ndị ụgwọ ụlọ ha agwụla ma ha enweghị ego ịkwụ ụgwọ ụlọ' Onye Naịjirịa ọzọ aha ya bụ Chinedu Ichoku kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ ndi Naijirịa na ndịisi ojii ọzọ na-eme na Dubai soro ebute nsogbu a. O kwuru na gọọmentị UAE enyela iwu ka ndị akwụkwo obibi ha mebiri site n'ụbọchi mbụ nke ọnwa Maachị ruo ụbọchị iri na asaa nke Ọgụstụ si mba ahụ pụọ. Ichoku na-akọwa na ọ bụ ụlọọrụ Naijirịa bụ ndị kpọtara Airpeace ha ji akpọpụ ndị Naijirịa. O kwukwara si: ""ụfọdụ ndị a enweghịzị ebe ha bi nke mere na ebe ọbụla ha hụru ha arahụ. Onye ntaakụkọ sị na ya hụrụ ndị Naịjirịa na-arahụ n'ezi Onye ntaakụkọ nọ na Dubai aha ya bụ Ashleigh Stewart etiela mkpụ na ndị Naijirịa mmadụ iri atọ na ise tọrọ na mba na-arahụ n'ezi. Stewart depụtara nke a n'akara twitter ya ebe o gosiri ndị o si bụ ndị Naijirịa ka ha na-arahụ ụra n'ọgige nlepụ anya dị na mba Dubai. O kwuru na ụfọdu n'ime ha anọọla ebe ahụ ụbochị ole na ole ebe ụfọdụ anọruola izuụka atọ. Ọ kọwara na ọ bụ otu ihe ka ha niile na-ekwu nke bụ na ụloorụ ha kwụsịrị ịkwụ ha ụgwo ọrụ nke mere na ha enweghịike ịkwụ ụgwo ụlo ha. Stewart kwuru na ndị a gwara ya na ha arịọla gọọmentị Naijirịa ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka. Ọ rịorọ ka ndị mmadụ gbatara ha ọsọ enyemaka. Cheta na gọọmentị Dubai wepụtara ohere ịkpọlata ndị Naijirịa akwụkwọ obibi ha gbajọrọ site n'ọnwa Maachị ụgbọelu na efu. Ha kwuru na ọ bụ ugboro atọ ka ha ga-eme nke a ma kọwakwaa na ndị nke a metụtara nwere tutu ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgụst ịpụ UAE. Ihe gọọmentị Naijirịa kwuru BBC kpọtụrụ Abike Dabiri-Erewa bụ onye na-ahu maka ndị Naijirịa bi n'ofesi ka otinye ọnụ na ya bụ ọkwụ. Kama ugboro ugboro ole a kpọrọ ekwe ntị ya ma enweteghị ya. Ọ saghịkwa ozi BBC tinyere n'akara ekwenti ya. Kama, akara Twitter ngalaba Dabiri-Erewa n'isi ya bụ nke Bekee kpọrọ ""Nigerians in Diaspora Commission"" dere na ndị Naịjirịa ikpeazụ tọrọ na mba Amerịka ga-alọta taa." egwuregwu-50920134,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50920134,Boxing Day: Southampton akụọla Chelsea ihe Anthony Joshua kụrụ Ruiz,Taa bụ 'boxing day' adịghị ndị Chelsea mma n'ahụ dịka ndị Southampton kụwara ha anya n'azụ owere ha.,"Ndị Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbarie 'Stamford Bridge', gbanye ndị Chelsea ose n'anya. Nwafọ Naịjirịa bụ Michael Obafemi bụ onye buru ụzọ gbakaa neetị na nkeji 31. Obafemi, onye gbara naanị afọ 19 bụ mba Ireland ka ọ na-agbara. Na nkeji 73, Nathan Redmond mezuru ya abụọ wee mee ndị Chelsea otiwere anya ahụ ụzọ. N'aka nke ọzọ, Mikel Arteta malitere ije ya dịka onye nkuzi ndị Arsenal taa, mana o nwetaghị mmeri. Arsenal na ndị Bournemouth gbara onye lawa onye lawa. Dan Gosling nke Bournemouth nyere goolu na nkeji 35, mana Pierre Emerick Aubameyang sara ya na nkeji 73. Arteta ga-eji nke a mata na ihe chere ya n'ihu n'otu egwuregwu Arsenal abụghị ọgụ nne na-agbara nwa ya. Manchester United akụpịala ndị Newcastle Marcus Rashford achakeela nnọọ ka ọkụ Ọkpụ goolu anọ asatara otu ka ndị Manchester United ji tie ndị Newcastle mmọnwụ. Marcus Rashford, Mason Greenwood na Anthony Martial nyere goolu anọ ahụ. Martial nyere goolu abụọ ebe Matty Longstaff nyetaara ndị Newcastle otu goolu. Paul Pogba so gbaa bọọlụ nke taa Ihe kacha tọọ ndị Man Utd ụtọ n'egwuregwu nke taa bụ na Paul Pogba alọghachila. Pogba agbabeghi bọọlụ ogologo oge n'ihi ahụ o merụrụ. Mana Carlo Ancelloti ji mmeri wee malite ọchịchị ya n'Everton. Everton ji otu ọkpụ goolu merie Burnley. Crystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie West Ham, ebe Aston Villa meriri Norwich 1-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi" afirika-47771424,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47771424,South Africa Xenophobia: Mwakpo 'Xenophobia' ataala isi mmadụ ruru 600 kamgbe 2006,"N'ime ụbọchị ole gara aga ndị ngagharịiwe malitere ọgbaaghara na Johannesburg bụ isi obodo azụmaahịa mba Saụt Afrịka, mebisie ụgbọala ma na-ezụ ngwaahịa nke ndị mbịambịa nwe.","Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka Ndị ọrụ gọọmentị mba Saụt Afrịka na-ekwu na ọ bụ ndị ohi na ọ bụghị mwakpo ịkpaoke agbụrụ. Agbanyeghi nke a, gọọmentị Naịjirịa akpọọla onye na-anọchite anya Saụt Afrịka na Naịjirịa, kwuo na ọ bụ azụmaahịa ụmụafọ Naịjirịa ka ha na-awakpo. Kedụ etu mwakpo ndị mbịarambịa si malite nakwa etu o si akawanwe njọọ? Agbanyeghị na ọtụtụ ndị Saụt Afịrịka na-ekwu na ọ bụ iwe n'ihi ihe na-esiri ha ike na-akpata ụdịri omume a, ya bụ ihe a abụghị ihe taa. ""Xenophobia"" Saụt Afịrịka Xenophobia bụ ogbugbu mmadụ makana ọ bụ onye mbịarambịara. Ihe a dị n'ọtụtụ mba, mana ọ bụ Saụt Afịrịka ka ọ bụ akụkọ kwamgbe na nsonso a. Ebe a ka ọkachasị taa akpụ. Na mba, ndị kachasị buo ibu bụ ndị isi oji. Ndị tara ezigbote ahụhụ n'aka ndị ọcha kpasịrị ha oke agbụrụ site n'ọchịchi nchịgbụ akpọrọ ""apartheid"" na Bekee. Ugbua, ọ bụ ndị isi oji bụ ndị obi na-agbawa makana ndị si mpaghara Afịrịka ọzọ nọ na mba ahụ arụ ọrụ ma na-azụ ahịa. N'ime afọ iri gara aga, ọtụtụ ndị isi oji si Naịjirịa, Zambia, Malawi na ọtụtụ mba ndị ọzọ anwụọla na mwakpo ndị a. Agbanyeghi na goomenti Saụt Afịrịka na-akatọ mwakpo ndị a, ma na anwụchị ndị aka ha dị na ya, ọ ka na-eme kwamgbe kwamgbe. N'ọnwa Mee 2008 Ndị ntaakụkọ kọwara ihe mere n'obodo Johannesburg n'ime afọ gara aga dịka ""agha"". Ọgbaghara dara ebe ahụ gburu mmadụ 62 ma chụpụ mmadụ 6,000 n'ụlọ ha bi. Ndị uweojii jidere mmadụ 200 kpara ajọ ike dịka iwakpo nwaanyị n'ike na ohi na ya bụ ọgbaghara. Ihe karịrị mmadụ puku iri so mee ngaghari iwe maka ""xenophobia"" n'afọ 2015 na Durban Nwakpo nke a metụtara ndị Zimbabwe karịa mana ometụtakwara ndị Naijirịa. Maach 2012 Agbanyeghi na mwakpo abataghi n'oge a, Saụt Afịrịka rịọrọ Naịjirịa mgbaghara etu ha ji chụla ndị Naịjirịa dị 125 n'ihi okwu akwụkwọ ""Yellow Fever"" ha sị bụ nke adịgboroja. Naịjirịa sị na ọbụ oke agbụrụ mere Saụt Afịrịka jiri mee ihe a. Eprel 2015 Ihe ruru mmadụ ise nwụrụ na obodo Durban mgbe ndị Saụt Afịrịka nwakporo ndị mbịarambịa dịka eze ndị Zulu bụ Goodwill Zwelithini sị ka ndị si esi laghachi mba ha. Agbanyeghi na o mechara sị na ndị mmadụ ghọtaghiere ya, ndị mmadụ ji okwu ya ahụ kpaa ume iji wakpo ndị agbataobi ha. Puku pụ puku ndị mbịarambịa achụpụrụ n'ụlọ gbara ọsọ ndụ Ọgọst 2018 Ndi uweojii na Soweto sị na mmadu atọ lara mmụọ n'ọgbaghara metụtara ụlọ ahịa ndị mbịarambịa. Ọtụtụ ndị ihe metụtara bụ ndị si mba Somalia. Akụkọ sị na okwu bidoro mgbe otu onye Somalia gbagbụrụ otu onye Saụt Afịrịka bịara izu ohi n'ụlọ ahịa ya. Ha zuru ohi ngwa ahịa ma kwasa ụlọ ahịa onye Ethiopia a" 45205146,https://www.bbc.com/igbo/45205146,Buhari: Ihe Ndigbo na-ekwu maka ya ịzọ ọchịchị ọzọ na 2019,"Ebe ụfọdụ ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu na ekwu na okwu aka na-achị Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal kwuru banyere Buhari adabachaghị, ndị ntorobia sị na okwu ya bụ eziokwu.","Nsonso a, Tambuwal kwuru na agbanyeghị na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye na-akwụba aka ya ọtọ, na nka na ọrịa ga-abụ nsogbu ya ịzọ ọchịchị na 2019. Tambuwal kwuru nke a oge otu dị icheiche dị na steeti ya gara ya njem nkwado n'obi gọọmenti steeti ahụ. Gọvanọ ahụ gọrọ na ya abụghị onye iro Buharị kwuru: ""Anyị hụrụ onyeisiala Buhari n'anya ma kwenye na ịkwụwa aka ọtọ ya na ezi echiche o nwere maka ala anyị."" Aminu Tambuwal bụ gọvanọ Sokoto steeti bụbu onye otu PDP tupu o fere APC ""Mana ihe ndị a ezughị. Anyị niile ma maka mmiri n'ehi n'ọchịchị n'ihi ọ kaala nka nakwa ahụ esighị ya ike. Ya mere ụmụ Naijiria ji chọọ ndị na-eto eto dịka ndị ga-edu ala anyị."" Tambuwal boro ebubo na o nwere ndị ọ bụ ha were ike ọchịchị na-arụzị ọrụ dịrị onyeisiala. Muhammadu Buhari gara njem ezumike na Lọndọn ihe karịrị abalị 10 gara aga N'otu aka ahụ ọ kọwapụtara na o nwere ndị na-akwalite ya ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. Ma kwuo na ya ga-ekwupụta ebumnuche ya gbasara nke a n'abalị ole na ole na-abịa. Mana ụfọdụ ndị Igbo nwere agba na-ekwu na Tambuwal ekwuteghị ya. N'okwu ya, onye isi otu pati UPP bụ Chekwas Okorie, kwuru na, ""Ọ bụ ụmụ Naijiria ka ọ dịrị ikwu onye ga-abụ onyeisiala na 2019, na agbanyeghị afọ maọbụ ọnọdụ ahụike."" Okorie katọrọ Tambuwal maka ihe o kwuru sị na okwu ya (Tambuwal) bụ mere n'ihu, gwọpụtụ n'azụ nke agaghị ewetara ya ezi aha. N'otu aka ahụ, onyeisi otu Ohaneze n'Abia steeti bụ Ezechi Chukwu kwuru na, ""Afọ ekwesịghị ịbụ ihe aga agbanye ụkwụ ma ọbụrụ na onyeisiala nwere ahụ ike ị nọ n'ọkwa ya."" Mana ọ kpọrọ oku ka e nwee atụmatụ ga-eme ya iwu na onye ọbụla chọrọ ịzọ ọchịchị iwepụta akwụkwọ ọnọdụ ahụike ya tupu ọ banye n'ọchịchị. Ọ sị: ""Tupu mmadụ apụta ịzọ ọchịchị, o nwe asambodo na-egosi ọnọdụ ahụike ya."" Ihe ndị ntorobịa Igbo na-ekwu Mana ụmụ Igbo na-eto eto kwụnyere n'okwu Tambuwal. Kingzubi Ozumba sị ""Nkeca bu eziokwu. Buhari emeela okenye ọ ka mma ka o jee zue ike."" Obiora Godwin kwuru : ""Nwa amadi a kwuru nke bụ eziokwu. Buhari akala. ""Ọ bụghị naanị nka, onye oru oyibo ọbụla na-aga ezumike nka mgbe ọ gbara iri afo isii. Kedụzi ka onyeisiala ga-esi na-apụta ịchị ọzọ ebe o gbalara iri afọ asaa na ụma."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" 44897367,https://www.bbc.com/igbo/44897367,Nwoke okwesịrị inyere nwunye ya aka n’ezinaụlọ?,"BBC Igbo jụrụ ma nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka ịrụ ọrụ n'ụlọ ha, ụfọdụ kwere, ebe ndị nke ọzọ ekweghị.","Ọ bụghị ihe mara ndị mmadụ ahụ na mba Afrịka ka nwoke bụ dibia ụlọ na-arụ ụfọdụ ọrụ dị n'ime ụlọ ya na nwunye ya bi. Mgbe mbụ, a na-ewe ya na ọrụ ndị dịka isi nri, ịza ụlọ, ịsa efere, iku nwa, ịsa akwa nakwa ndị ọzọ, abụghị ọrụ nwoke na-arụ n'ezinaụlọ, ọkachasị na mba isi ojii Afrịka. Maka na ndị Afrịka na-eme alụmdinanwunye ebe nwunye ga-ewe di ya dịka 'chi', tụmadụ ndị Igbo. Mana ugbua, okwu dị ka ọdagharịala, maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị ugbua na-ele anya na di ha ga-enyere ha aka n'ụlọ. Kaosiladị, ụfọdụ ụmụnwoke anaghị eche ka a gwa ha agwa maọbụ rịọ ha biko tupu ha rụọ ọrụ ndị ahụ akpọpụtara n'elu, ebe ụfọdụ nwere ike iwe ya ka mkparị. Mgbe gboo n'ala Igbo, nwaanyị ga-esicha nri bunye di ya ka o rie, di ya agaghị etinyere ya aka Ka BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ""Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka ime ihe ndị dịka isi nri, ịza ụlọ, ịsa efere, n'ezinaụlọ?"" Ha zara azịza dị iche iche. Chioma Osuala kwuru sị ""onweghị ihe dị njọ dị na nwoke inyere nwunye ya aka. Ma na ọdịghị mma ka nwunye ya were ya ka ihe mkparị."" Mgbe gboo, ọ bụbụ ọrụ nwaanyị ịlekọta ụmụaka n'ezinaụlọ Chukwuogo Umejiaku sị ""Ọ bụghị iwu, onye chọọ o mee"". Okechukwu Mba kwuru sị, ""Ana m emebu ya mbụ tupu nke nwaanyi abata. O nwebeghị ihe m hụtara ga-eme ka m kwụsị inyere ya aka kama agwa ya."" Gụọ ihe ndị ọzọ kwuru maka ya ebe a: Ị nwekwara ike tinye ọnụ gị n'okwu a. Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka n'ezinaụlọ? Ego nwunye gi na-akpata ọ ga-eme ka ị lakwuru ya n'obodo ọzọ Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49592390,https://www.bbc.com/igbo/49592390,Nicki Minaj: ihe isii ị maghị maka nwada a na-apụ ọkụ,Otiegwu mba Amerịka Ama ama bụ Nicki Minaj ekwuola na ya n'achịsa ọwa n'ihe e jiri mara ya.,"Minaj onye kwuru nke n'ụbọchị Tọzde ekwughị ihe o ji ahapụ ọgbọ ugbua karịa na ya na-aga ibido ezinaụlọ mana o kwughị ma ọ dị ime. Cheta na nsonso a ọ gbara ama na ya na Kenneth Petty gara kwegharia nkwa alụm di na nwunye. Ọkwa ahụ ọ mara adịghị ndị ihe ya na-amasị mma dịka ha wujuru soshal midia na-atụ arịrị maka ya. Ihe ise ịmaghị maka ya: Nnamdi Kanu: O nweghị mgbe m kwuru na m ga-akpọlata ndị Ipob nọ Saụt Afrịka Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agọrọla isi onwe ya n'okwu na-efegharị na ọ ga-akpọlata ndị IPOB ọbụla nọ na Sawụt Afrịka na-efu maka okwu Xenophobia. Onye aka nri ya bụ Paul Achalla ama a n'ekwentị mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya. Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere N'ọnụ Achalla ""Nnamdi Kanu agwala ndị Ipob ọbụla ha kwụsị ịga Naịjirịa kemgbe edenyere aha ha dịka otu ndị na-eyi ndụ egwu"" Okwu a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa họpụtara ụgbọelu Airpeace iji bulata ụmụ Naịjirịa ọbụla chọrọ ịsi mba Sawụt Afrịka lọghachite. EFCC anwụchiela otu ọkammụta na ndị ọzọ maka mpụ Ụlọọrụ Efcc ekwuputala aha mmadụ iri na abụọ gụnyere otu onye ọkammụta na Mahadum Ahmadu Bello maka mpụ na igwu wayo. Akpụpụrụ ndị a ụlọikpe ebe onye ọkaikpe nyere iwu ka ọkwụọ dọlla nde iri n'ụgwọ mgbapụta rue mgbe a ga-anụ ikpe ya ọzọ. Aha ndị ahụ bụ Olaleye Kolapo, Madukife Ifeanyi Azuka, Fatanmi Yinka Sunday, Adebayo Bolaji Adeyinka, Adeleke Peter na Adebowale Fadairo. Ndị ọzọ bụkwa Oyewunmi Toulope Michael, Bello Ayoade Jalal Arikalam, Owolabi Toheeb Toluope, Abdullahi Abdulazeez Oluwatobi, Temitope Fatolu na Adesina Adewale. David Umahi agaala obi gọọmentị taa Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi agaala njem nleta n'obi ghọọmentị etiti bụ Aso Rock izute onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari. Amabeghị ihe ndị ha ga-akpa mana ọ ga-apụta ihe n'oge adịghị anya. Madagaska esorola nzọmụkwụ Zambia Mba Madagascar esorola nzọmụkwụ mba Zambia n'ịsepụ ụkwụ ha n'asọmpị enyi na enyi dị n'etiti ha na mba Saụt Afrịka. Madagaska mere nke a iji gosi uche ha gbasara okwu Xenophobia na-ewu na Saụt Afrịka. N'egwuregwu, Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011 Samson Siasia bụ aka na-achịkọta bu otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa emeela mkpesa banyere mmachi ebighebi nke FIFA machiri ya. O kwuru na mkpesa bụ iji gosi na aka ya kwụ ọtọ n'ebubo niile eboro ya. Gee nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọgbaaghaara Ịkpaoke agbụrụ Ozi na erụ anyị ntị ugbua na-akọwa na gọọmentị mba Saụt Afrịka emechiela ụlọọrụ nnọchite anya ha dị na Legọs, Naịjirịa. Ha sị na ọ bu maka ịchekwa ndi ọrụ ha dịka ngagharị iwe emere na Legọs butere ndị mmadụ ịwakpo ulọ ọrụ ndị ha sị ndị Saụt Afịrịka nwe. Nke a na-abịa n'azụ Naịjirịa kpọlatala onye nnochite anya ha na Saụt Afịrịka. Naịjirịa gbajọkwara nzụkọ ngalaba ""World Economic Forum"" Osote Onyeisiala Osinbajo kwesiri ịnọ na ya. Airpeace wepụtara ụgbụọelụ maka nnọlata Dịka ịkpaoke agbụrụ nke Saụt Afrịka na-aga n'ihu, Ụlọọrụ ụgbọelụ Airpeace ekwụọla na ha ga-eweputa ụgbọelụ maka ndị Naịjirịa niile chọrọ ịlọta. N'akwụkwọ ọ degara Minista na ahụ maka mekọrịta ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyema, onyeisi ọrụ Airpeace bụ Oluwatoyin Olajide kwụrụ na agaghị agba nkiti ka ya bụ ewụ mụọ n'ọgbụ. Ụlọikpe awụọla Exxon Mobil na Shell n'ala Ụlọikpe n'Amerịka awụọla Exxon Mobil na Royal Dutch Shell n'ala gbasara akwụkwọ ha gbara ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa bụ NNPC. Exxon Mobil na Shell rịọrọ ya bụ ụlọikpe ka ọ manye NNPC ka o kwụọ nha otu ijeri dọla na ụma asatọ maka na ọ mezughị nkwa ha ịmịta mmanụ n'afọ 1993. Mana ụlọikpe jụnyụrụ anya pịị. Ụlọikpe atụọla nwụnye onyeisiala mkpọrọ Rosa Elena Bonilla Leekwanụ na-atụọla nwụnye onye chiburu Honduras bụ Rosa Elena Bonilla nga afọ iri ise na asatọ maka mpụ na oke ego asị na omefuru mgbe dị ya nọ n'ọchịchị site n'afọ 2010 ruo 2014. Ọkaiwu ọrịakụ Bonilla na-ekwusi ike na aka ya bụ nwaanyị dị ọcha na ya ga-aga ụlọikpe mkpegharị iji zọpụta ya na ndagwuru nke ọnwu. itozuoke iko mbaụwa 2022 ebiriala ọkụ Asọmpi itozuoke iko mbaụwa 2022 malitere n'ikem n'ikem ụbọchị Wenezde, mba iri abụọ na asatọ ọkpa esicheghị ike n'Afrịka ga-anwa ike ha maka isonye. Cheta na Naịjirịa na mba iri abụọ na isii ndị ọzọ nke Afrịka etozuolarị na echezi ibe. Nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43932900,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43932900,Mbikọrita n'udo Naịjirịa dị mụ mkpa-Buhari,Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-ekwusi ike na mbikọrita n'udo ụmụ Naịjirịa dị ya oke mkpa.,"Buhari kwuru na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ na ntụliaka 2019 N'ime akwụkwọ onye na-ekwuchitere ya ọnụ bụ Femi Adesina dere,onyeisiala kwuru na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime i ji hụ na ụmụ Naịjirịa na-ebikọta ọnụ n'udo. Adesina kwuru na onyeisiala kwuru nke a mgbe ọ nabatara ndị ọbịa nke onye ndụ ha bụ Sheikh Muhammadu Mahi Ibrahim Inyass n'ụlọ ọchịchị. Ụfọdụ ndị Naịjiria na-ekwu na Buhari adịghị ike ọrụ maka ịzọ ọchichị ọzọ Buhari kelere ndị isi ụka alakụba ahụ maka otu ha si mee ọgbakọ n'udo maa yọọkwa ha ka ha webata ya bụ udo n'ikwado mbikọrita n'udo n'etiti ndị Naịjirịa. Onyeisi ụka alakụba kwekwara Buhari nkwa na ya ndị otu ya ga-eme ihe niiole ha nwere ike mee iji hụ na ha kwadoro ọchịchị ya. Inyass kwukwara na ihe mere ha ga-akwado Buhari bụ maka ihe ọma ọ na-emere ndị Naịjirịa. Okwuru na ya ndị otu ya kwetere na Buhari na ndị so ya nọrọ nọ ọchịchị bụ ndị aka ha kwụ ọtọ nakwa na-atụ egwu Chukwu. Akụkọ ga-amasi gi:" afirika-44200301,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44200301,Gịnị na-ebute esomokwu n'etiti uweojii na ndị agha?,"Na Naịjirịa, anyị anụọla ọtụtụ oge na ndị agha na ndị uweojii Naịjirịa na-akụnye aka, nke na-ebute ogbugbu mmadụ na nkwarị akụnaụba.","Oteela ndị uweojii na ndị agha na-enwe mkpakpa di icheiche na Naịjirịa Ọtụtụ oge, ọ bụ ihe na-adịghị mkpa bụ ihe na-ebuta mkpamkpa a, dịka nke mere na Yobe steeti n'ime ọnwa Epureel n'afọ 2017. Dịka akụkọ siri kwuo, ndị uweojii na ndị agha n'ime steeti ahụ busoro onwe ha ọgụ maka esemokwu gbasara enyin nwaanyị ha. Otu onye bụ onyendu ndị agha Naịjirịa boro onye uweojii na ọ napụrụ ya enyin nwaanyị ya. Ndị uweojii na ndị agha na steeti ahụ lụrụ nnukwu ọgwụ maka okwu a. Ka anwụru kopuru, ozu ndị uweojii anọ na otu onye agha tọgbọrọ. Ọzọ dị ka ya mekwara na obodo Calabar n'ime ọnwa Dezemba na afọ 2016, na mkpa mkpa nke a, otu uweojii na ndị agha gbatara onwe ha mgbo mana onweghị onye meru ahụ maọbu nwụọ. Ihe a na-eme na-agbogwoju ndị mmadụ anya, nke mere ha jiri na etinye ọnụ na ya bụ okwu na social media dịka ‏@FinallymaRvin sịrị de n'ebe. O dere na ya ahubeghị ebe ndị ọrụ gọọmentị abụọ na alụso onwe ha ọgụ na uwa nke a, mana na Naịjirịa ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa na aluso onwe ha ọgụ maka onye ga-eche obodo maka mwakpo Boko Haram. Mkpamkpa ọzọ mere n'etiti ha bụ nke mere na ọnwa Dizemba na afọ 2017 na Ekiti steeti. Na mkpamkpa nke a, ndị uweojii na ndị agha were nghọtaghị onwe ha maka onye ikpe ga-ama maka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị atọọrọ na Dapchi. Cheta na ndị uweojii na ndị agha nọ na Yobe oge Boko Haram tọrọ ndị ụmụakwụkwọ a. Ihe nkiri na-ewu ugbua bụ nke gosi ka ndị uweojii na alụsọ otu onye Civil Defence ọgụ, ha na-achọ ị napụ ya egbe ya n'ike. Nke a mere na Akwa Ibom steeti. Gịnị butere udi emume a? Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ọ gịnị mere na ndị ọụ nchekwa enweghị ike ịdị n'udo? Oge ọbụla ndị ntaakụkọ jụrụ ndị uweojii ajujụ ịmata ihe mere udi ihe a na-eme oge ọbụla, ha asị na ọ bụ obere esemokwu dị na-etiti ha. Ha kwukwara na ha abụọ na arụkọ ọrụ ọfụma ọfụma. Mana otu ọkaiwu aha ya bụ Chuwkwuemeka Eze, gwara BBC Igbo na udi emume a na-ekesa mmerikọrịta dị na-etiti ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa. N'ọnụ okwu Eze: ""Ogbaghara dị icheiche n'eme na mpaghara Naịjirịa, ọ dị nwute na ndị kwesiri na-echekwa udo na ala bụ zị ndị na ebuso onwe ha ọgụ"". Olisa Metuh adala n'ụlọikpe Ndị uweojii achụsasịala ndị Ipob n'Awka" afirika-47042612,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47042612,Esha Gupta edegarala Iwobi akwụkwọozi mgbaghara maka ịkpọrị ya,"Esha Gupta, onye ihe nkiri India, arịọla onye egwu bọọlụ Alex Iwobi ka ọ gbaghara maka ịkpọrị ya.","Arsenal jịkọrọ Esha Gupta na Alex Iwobi N'akwụkwọ ozi mgbaghara o dere, Gupta kwuru na "" O wutere m nke ukwu agwa m mkpara na Fraide gara aga. E nweghị m ike ịkọwali etu ihe mere siri mejọọ gị."" O rịọkwara otu egwu Arsenal mgbaghara ma kwe nkwa ya agaghị akpa n'ụdị agwa ahụ nke metụtara ikpa oke agbụrụ ọzọ. Esha Gupta bụ onye na-anọchite otu Arsenal N'izu gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ n' ụwa niile katọrọ Esha Gupta bụ onye na-anọchite otu Arsenal (brand ambassador) maka ịkparị nwa afọ Igbo na-agbara Arsenal Bọọlụ bụ Alex Iwobi. Gupta, onye ihe nkiri India ama ama kpọrọ Iwobi 'nke ahụ dị ihu ka ọzọdịmgba.' Gupta mechara rịọ mgbaghara sị na ya amaghị n'okwu ya gosiri ịkpa oke agbụrụ, ma wepụ okwu ahụ n'elu igwe ịntanet. Mana ọtụtụ ndị mmadụ anabataghị arịrịọ ya. @babuyagu kwuru na okwu ya egosighị n'ezie n'ihe Gupta mere wutere ya. Ụfọdụ kporo oku ka a mabido ya. Ka ọ dị ugbua ma Iwobi ma Arsenal enwebeghị ihe ha kwuru maka okwu a. Otu onye dị Iwobi n'ahụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na Iwobi nweghị okwu ọ ga-asa nwata nwaanyị ahụ. Ọ gara n'ihu sị na Gupta maghị ihe ọ na-ekwu. "" Ihe ka mma ime ụdị ya bụ ịgba ha nkịtị."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47019235,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47019235,Fake Universities: Lee mahadum adigboroja na Naịjirịa ugbua,Ọtụtụ ụmụakwụkwọ na Naịjirịa n'oge gara aga akọwapụtala ka ha si danye n'aka mahadum adịgboroja.,"Nke a emeela ka ụlọọrụ ""National Universities Commision"" (NUC) wepụta ụzọ ole na ole ụmụakwụkwọ ga-esi gbanarị ịdanye n'ọnwụnwa a. Cheta na akụkọ pụtara na gọọmenti etiti machiri mahadum otu nari na iri ato na atọ makana ha megidere iwu. Gọọmenti etiti kwuru na mahadum ndị a na-alafụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa ma na-eme ka mbọ ha bụrụ ihe efu. Onye mgbasa ozi ụlọọrụ NUC bụ Maazi Ogbonnaya Okoronkwo kwuru na ụzọ mbụ eji amata mahadum adigboro bụ: Maazi Okoronkwo kwuru na NUC na ndị uweojii na-ejikọta aka ịgbasa ozi a ọfụma. Mgbe BBC jụrụ ya maka aha mahadum ndị a machiri, o kwuru na ọ ga-agwa anyị ma ha wepụtacha ya. Lee ụfọdụ mahadum agbachiri n'atụmatụ a dịka Maazi Ike Onyechere bụ onyeisioche ""Exam ethics Marshall International"" si zitere anyị. 1.University of Accountancy and Management Studies2.Christians of charity American University of science & Technology, Nkpor, Anambra3.University of industry, yaba, Lagos4.University of Applied science and Management, port Novo Republic of Benin5.Blacksmith University, Awka6.Volta university college, Ho, Volta Region, Ghana7. Royal university Izahia, P.O Box 800, Abakaliki, Ebonyi8.Atlanta university, Anyigba, Kogi State9.United Christian University, Macotis Capus, Imo State10.United Nigeria University college, Okija,Makurdi, Benue STATE11.Samuel Ahmadu Bello University, Makurdi, Benue State12.UNESCO University, Ndoni, River State13.Saint Augustine's University of technology, Jos, Plateau State14.The International University, Missouri, USA, Kano &Lagos Study Centre15.Collumbus University, UK16.Tin International University, UK 17.Pebbies University, UK18.London External Studies, UK19.Pilgrims University20.Lobi Business School Makurdi, Benue State21.West African Christian University22.Bolta University college, Aba23.JBC Seminar Inc. (Wukari Jubilee University) Kaduna Illegal campus24.Westlan University, Esie, Kwara State25.St. Andrews University college, Abuja26.EC-Council University, USA, Ikeja Lagos Study Centre27.Atlas University, Ikoy Udoso Uko, Uyo Akwa Ibom State28.Concept College\University (London)29.Halifax Gateway University, Ikeja30.Kingdom of Christ University, Abuja31.Acada University, Akinlalu, Oyo State32. Fifom University, Mbaise, Imo State33.Houdegbe North American University Campuses in Nigeria34.Atlantic International University, Okija, Anabra State35.Open University Akure36.Middle belt University (North Central University), Otukpo37.Leadway University, Ughellil, Delta State38.Metro University, Dutse\Bwari, Abuja39.Southend University, Ngowuro Egeru(Afam) Ndoki, River State40.Olympic University, Nsukka, Enugu State41.Federal college of complementary & alternative medicine, Abuja42.Temple University, Abuja43.Irish University of Business school London44.National University of Technology, Lafia, Nasarawa State45.University of Accountancy & management studies, Mowe, Lagos -Ibadan46.University of Education,Winneba Ghana, operating anywhere in Nigeria47.Cape Coast University, Ghana, operating anywhere in Nigeria48.African University Cooperative Development (AUCD), Cotonou, Benin Republic49.Pacific Western University,Denver, Colorado, Owerri study center50.Evangel University of America & Chudick Management Academic, Lagos51.Enugu state University of science & Technology (Gboko Campus)52.Career Light Resources Center53.University of West Africa, Kwali-Abuja, FCT54.Coastal University, Iba-Oku, Akwa Ibom State55.Kaduna Business School, Kaduna56.Royal University of Technology, Mina, Niger State57.West African Union University, in collaboration with International professor college of Administration, Science & Technology, Nigeria58.Gospel Missionary Foundation (GMF), Theological University165 Iselo Road, Cele Bus Stop. Egbe-Ikotun, Lagos59.National University of Nigeria, keffi, Nasarawa State60.North Central University, Otukpo, Benue State61.Christ Alive Christian Seminary & University, Enugu62.Richmond open university, Arochukwu, Abia State63.West coast university, Umuahia64.Saint clements university, Iyin Ekiti, Ekiti State65.Volta university college, Aba, Abia State66.Illegal satellite campuses of Ambrose Alli university Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 57045520,https://www.bbc.com/igbo/57045520,Father Okunerere: Ihe mere anaghị m agba alụsị m butere ọkụ dịka ụkọchukwu ndị ọzọ,"""Amaghị m ihe mere ndị ụkọchukwu na ụka ndị ọzọ ji agba ụmụ arụsị a ọkụ.","""O nwere ike ọ bụrụ ụjọ"" Nke a bụ ajụjụ si n'ọnụ Rev, Fr, Paul Obayi bụ ụkọchukwu Katọlịk e ji Okunerere ere wee mara. Fada Okunaereere na-edowe alụsị o wetere na-ebe ọ gara amụma na ekpere. Ọkunaerere siri na ọ na ọ bụ ndị mmadụ na-akpọ ya oku tupu ọ gawa njem ibute alụsị ndị a. Ọ kpọgharịrị anyị ebe ahụ ọ na-edewe ya bụ arụsị dị iche iche ma kọọrọ anyị akụkọ so ha n'otu n'otu. N'ime ya ọ kọwara ihe mere ya jiri ahapụ ime ka ibe ya site na-ịkpọ alụsị ndị a ọkụ. Ihe o kwuru n'uju dị n'ihe nkiri a dị ebe a: Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo." afirika-54833739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54833739,Pandemic Prevention Fee: Ihe anyị ma maka ụgwọ a sị ụmụakwụkwọ ABSU kwụọ,Ụmụ akwụkwọ mahadum steeti Abia bụ ABSU egosila iwe ha maka ụgwọ 'Pandemic Prevention fee' nke a sị ha kwụọ.,"N'ime akwụkwọ ozi na-efegharị na soshal midia, a sị ha kwụọ ""Pandemic Prevention fee ruru puku iri na ise iji nwe ohere denye aha ha ma lee ule"". End of Twitter post, 1 Ha kwukwara na agụmakwụkwọ ga-ebido n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba. Onyebuchi Ememanka na-ekwuchitere Gọvanọ Okezie Ikpeazụ ọnụ gwara BBC Igbo na ego ahụ bubu naira puku iri abụọ na ise, mana mgbe ya na ndị isi ụlọakwụkwọ nwere nzụkọ n'ụbọchị Wenzde, o kpebie ịwedata ya bụ ego rue naira puku iri na ise. Ememanka kwuru si: ""ọ bụghị m ka ọ dịrị ịkọwa ihe ya bụ ụgwọ pụtara nakwa ihe a ga-eji ya mee, ọ bụ Mahadum ahụ ka ọ dịrị"" O kwukwara na gọọmentị agaghị enweike ịkwụrụ mmadụ niile ụgwọ ịme nyocha maka covid-19. Ndị Mahadum ahụ nakwa ndị ntoroọbia ndị ọzọ ka na-akatọ ya bụ iwu. Onye dị ka Benson Ibeabuchi na-ajụ ma ụgwọ ahụ a ga-echekwa ha n'ebe ọrịa ahụ dị Onye ọzọ bụ Glory na-ekwu ka ndị Mahadum ahụ kwụsị ịkapụ mmadụ ego n'aka." afirika-53437876,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53437876,Charles Egbu: Onyeisi ojii mbụ ga-abụ onyeisi Leeds Trinity Univserity,"Gọvanọr Anambra steeti bụ Willie Obiano ebunyere Charles Egbu onye bụ mbụ onyeisi ojii na-enweta ụdị ọkwa ahụ na Briten gbaa gburu gburu, ụkpa ekele maka ọkwa ọhụrụ a.","Obiano sị na ihe a bụ oke ihe nye ndị Naịjirịa, ọkachasị Anambra steeti maka na inwete ụdị ọkwa a n'ụlọakwụkwọ dị na UK abụghị asụ anwụrụ. Ọ gwara Egbu sị ọ kweyere na ọ ga-emechapụta ha ihu n'ọkwa maka na ọ maara na ndị n'ehi asaa n'anya n'inye mmadụ ọkwa. Charles Egbu si Abatete wuru ewu ụnyaahụ mgbe akpọpụtara aha ya dịka onyeisi ndị Leeds Trinity University dị n'England. Nke a na-abịa dịka Minista na-ahụ maka mahadum na UK bụ Chris Skidmore tichara mkpu na Jenuwarị na ọ nwebeghị onyeisi ojii ji ezigbo ọkwa na mahadum mba ahụ kemgbe. Ọkammụta Charles Egbu ga-amalite ọrụ dịka onyeisi Mahadum Leeds Trinity n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020. Ihe i kwesịrị ịma banyere ya Egbu gụrụ kwọntiti Sụvee jigodi mana o ji ọkwa dịka osote onyeisi (Pro-Vice Chancellor) na Mahadum East London. Ọ bụbu ""Dean"" nke ngalaba 'Built Environment na Architecture' na Mahadum nke South Bank ma Ọ bụ ọkankuzi n'ụlọakwụkwọ 'University College London'. Ọ deela akwụkwọ ruru iri na abụọ (12) nakwa ihe ndị ọzọ e biputara na jọnalụ karịri narị atọ na ụma iri na ise (350) gbasara otu e si ahazị ma arụ ụlọ, ụzọ, akwammiri na ihe ndị ọzọ na-enyere mmepe obodo aka bụ nke ọ nwere mmasị pụrụiche na ha. Egbu ga-anọchị anya ọkammụta Margaret A. House, onye nọgọrọna bụ ọkwa afọ asaa. Obiano jikwa ohere ahụ keele ndị niile mechapụtara steeti ya ihu n'ọgbọ a. Ndị dịka nwada Agnes Ego Maduafokwa bụ onye tuuru ugo dịka onye nke mbụ n'ụle akwụkwọ nke Jamba 2020. Chidubem Obi bụ onye kporo ndị ọcha n'ọkpa n'agụmakwụkwọ na mba Rọshịa,na ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43222386,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43222386,Umahi amachiela ndị ọchị ehi ịbata Ebonyi Steeti,Onye na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi amachiela ndị ọchị ehi na ehi ha isi steeti ọzọ bata Ebonyi nakwa ịkpa nri n'abalị.,"Ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị a na-ekwu na-akpa ike dị icheiche Mmachi a sitere n'ọgụ ndị Akaeze bụ obodo dị na steetị ahụ, na ndị ọchị ehi lụrụ. Gọvanọ Umahi sị na nanị ihe ga-eme ka anabata ndị ọchị ehi n'Ebonyi bụ ma ọ bụrụ na ha wetere ikike n'ebe ha si na ndị na-achị obodo ha na-aga. Umahi kwuru okwu ndị a ka ya na ndị Fulani na-achị ehi nwere nzukọ n'ụlọ gọọmenti n'Abakaliki. Ndị ọchị ehi na ndị ọkọugbo n'Akaeze nwere ọgbaghara n'ugbo, mana mgbe ajụrụ ha ajụjụ ha abụọ sị n'aka ha dị ọcha. Onye na-ekwuchitere ndị Fulani n'Ebonyi bụ Yusuf Sambo sị na mmadụ abụọ n'ime ha merụrụ ahụ ma nọkwara n'ụlọ ọgwụ n'Agwu nke dị n'Enugu Steeti ugbua. Onye na-ekwuchitere ndị Akaeze bụ Onyebuchi Ogbadu sị na nwafọ ha bụ Daniel Ngwoke merụkwara ahụ ma nọrọ n'ụlọọgwụ Federal Teaching Hospital nke dị n'Abakaliki. Maka etu okwu a siri dị, gọvanọ Ebonyi Steeti sị na ya ahaziela otu mmadụ atọ ga-agba izu, mee nchọpụta ma hụ na ndị aka ha adịghị ọcha na ihe a mere ga-ata ahụhụ. ""Ndị uweojii, ndị nchekwa obodo, ndị agha na ndị ihe a metụtara ga-eweta mmadụ abụọ ga-eme otu nchọpụta mmadụ 19, mana m ga-amachi ndị ọchị ehi ibanye Ivo mgbe a na-eme nchọpụta a,"" Gọvanọ Umahi kwuru. Gọvanọ Umahi gakwara n'iru ikwe nkwa na emechaa nchọpụta, ya ga-agba mbọ hụ na ""onye malitere nsogbu a ga-aga mkpọrọ"". Esemokwu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọkọugbo n'ebe dị icheiche na Naịjirịa. Esemokwu a ebutela ogbugbu ọtụtụ mmadụ na mmebi akụnụba. Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ndị agha na ndị uweojii ka ha ga mee nchekwa na Benue Steeti nakwa ebe ndị ọzọ nsogbu na-akpọtụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45862850,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45862850,Peter Obi: Ọ bụ eziokwu na Igbo enweghị otu obi?,"Kemgbe Abubakar Atiku were Peter Obi dịka osote ya na ya ga-akwụ zọọ ọkwa onyeisiala na 2019,etu ndị gọvanọ Alaigbo jịrị sị na ha agaghị akwadọ ya n'ihiị na ha 'akpaghị ya akpa.","Nke a bulitere okwu n'etiti ndị mba ọzọ nke ha jị arụ ndị Igbo aka dịka agbụrụ n'enweghị otu obi. Ọ bụghị naanị ha na-eche otu a, ndị ntorobịa Igbo ụfọdụ na-ekwukwa na nsogbu Igbo bụ Igbo, na Ndịgbo enweghị otu obi, kama ha bụ nshịkọ na-anọchị ibe ya ebe ọ galighi. Okwu ha abụghị okwu ọnụ efu n'ihi ọgbakọ ndị ndu PDP ọwuwa Anyanwụ na-eme n'isi Peter Obi abụghị nke mbụ Igbo na-akponye aja na garị ibe ha. Ọtụtụ mgbe, oke rutere Ndigbo na-agbalahụ ha dịka onye ọbụla n'ime ha na-achọ ọdịmma onwe ya, hapụ nke agbụrụ ya. Lee ọtụtụ mgbe Igbo wụrụ onwe ha n'ala n'anya agbụrụ ndị ọzọ n'ihi enweghiotu obi na nkwekọrịta: 1.Alex Ekwueme na Jim Nwobodo Ụmụ Naijirịa anaghị echefu akụkọ etu Jim Nwobodo jiri kerie vootu gaara enye Alex Ekwueme larala mụọ ohere imeri na ntuliaka imeụlọ pati PDP mere na Jos n'afọ 1999 maka ọkwa onyeisiala. 2. Ịzọ ọkwa onyeisi Sineti n'oge Ọchịchị Obasanjo Ọ bụ okwu metụtara adịghị n'otu nakwa ịchọ nke bụ nke onye mere na Ndigbo nyere ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa onyeisi ise naanị afọ asatọ Olusegun Obasanjo chịrị dịka onyeisiala Naịjirịa. Ọchịchị onyeisi Sineti sị n'aka Evans Enwere(1999) fere n'aka Chuba Okadigbo(1999-2000). O sikwara n'aka Okadigbo banye n'aka Anyim Pius Anyim(2000-2003). O sikwa n'aka Anyim banye n'aka Adolphuis Wabara (2003-2005) ma bie n'aka Ken Nnamani( 2005-2007.) Agbanyeghị na ebubo nrụrụaka na ọchịchị aka ike so na nkata gbudoro ha, mana o doro ewu na ọkụkọ anya na ndị Igbo nọ na Sineti oge ahụ so gwuo olulu loro nwanne ha. 3. Uwazuruike/Nnamdi Kanu Ọ bụghị naanị na ndọrọndọ ọchịchị ka Ndigbo na-egosi adịghị n'otu. Agbanyeghị na mkpu mnwereonwe Biafra bụ okwu na-eti ka ebilimmiri n'Igbo dum, adịghị n'otu emeela ka ọtụtụ otu kewapụta sị na ha na-agba mbọ ịlụrụ Ndigbo ọgụ mnwereonwe. Kemgbe MASSOB nke Ralph Uwazuruike bidoro malitere, Nnamdi Kanu kewara bido nke ya bụ IPOB. Ndị ọzọ gụnyere Biafra Nations Youth League (BNYL), Biafra Independence Movement (BIM) nke Uwazuruike siri na Massob pụọ ga-mepee, Zionist Movement nke Ben Onwuka dgz. A nyụkọghị mamịrị ọnụ mere na onye na-egwu n'elu, ibe ya a na-ekwu n'ala. Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru maka adịghinotu Ndịgbo Ihe ndị ma nke a na-akọ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na ihe kachasị mee Ndigbo asụọ ala ma akọghị ji dịka Elliot Ugochukwu siri kọwara BBC Igbo bụ na ọtụtụ ndị ndu Igbo na-achụ maka onwe ha na ezinaụlọ ha hapụ ọdịmma Igbo niile. Ugochukwu gara n'ihu kwuo na""Ndị ndu Igbo bụ ndị ndu enweghị ndị na-eso ha."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-51610462,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51610462,WBC: Anthony Joshua a na-atụ Wilder egwu?,Ihe na-ewu na soshal midia kemgbe Deontay wilder na Tyson Fury kụchara ọkpọ bụ maka onye bụ ọkaibe n'ọkpọ.,"Ebe ụfọdụ na-eche na Anthony Joshua ga-adọpụ Deontay Wilder akwa n'ukwu ọkachasị ka Tyson Fury kụpụchara ya kpakpando n'anya. Ndị ọzọ na-eche na ọ bụ Deontay na-atụ Anthony egwu. Wilder n'onwe ya gwaburu ndị ntaakụkọ na ""ha enyela Joshua otito ntogbu na-egbu nwa nkita nke mere isi ji ebuzi ya"". Ndị nkwado ha na-ekwu dịka o si gbasa ha. Ebe ndị nke Wilder na-asị na ọ bụ ezie na Joshua na atụ ya egwu ndị nke Joshua na-ekwu na nke ahụ be ọkpụrụkpụ asị. Ụfọdụ n'ime ha na-ekwukwa na onweghị onye na-atụ ibe ya egwu kama na ha ekwetabeghị otu aga esi kee ego ha ga-akụta na ya bụ ọkpọ. Ha na-ekwu na ọ bụ ndị nchikọta Wilder bụ Shelly Finkel na onye ntuziaka ya bụ Al Haymon ka ọ ka njọ n'isi. Shelly Finkel mgbe ọ na-ekwu okwu mgbe Tyson Fury na Deontay Wilder kụrụ ọkpọ Ndị a na-ekwu na anyaukwu mmadụ abụọ a ka njọ ebe ha na-achọ ka ekee ihe nrite ha nhata nha ma kụọ ya bụ ọkpọ na mba Amerika. Lee ihe nke a pụtara: Ọkpọ mbụ Wilder kuru bụ Pay Per View (PPV) bụ nke ya na Tyson Fury kụrụ. Nke a pụtara na ndị otu Joshua na-eche na o rubeghị ogo ka ya na ha kee ego ọkara. Ha sị na ha agaghị eji ya tunyere Anthony Joshua PPV ya rugoro otu nde kemgbe ya na Klitshchko kụchara ọkpọ na Apreelu 2017. Onwebeghị ndị katara ahụ n'ọkpọ ha na Wilder kụgoro ọkpọ na-abụghị nke ya na Tyson Fury nakwa nke Luis Ortiz. Ndị niile ha na Wilder kụbụru ọkpọ bụ ndị ""Cruiserweights"", dịka ndị a sị ekwu. Anthony Joshua akụọla ọkpọ 24 e merie ya n'otu, nweta ""knockout"" 21, ebe Deontay Wilder kụgoro ọkpọ 44 e merie ya n'otu ọ nweta ""knockout"" 41. Anthony Joshua ji nturuugo IBF, IBO nakwa nke WBA ""Super"" dịka ọ nụgoro ọgụ ụgboro iri abụọ omerichara. Wilder jibu nturuugo ọkaibe nke mbaụwa n'ọkpọ ruo ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị mgbe Tryson Fury napụrụ ya. Ọ bụ ihe ndị a kpatara ha ji kwusie ike na ọ bụghị ụjọ ka Joshua na-atụ. Mana kedu onye Anthony Joshua na-ahụ dịka ọgbatauhie? Ihe onyonyo ebe ajụrụ Athony Joshua onye ọ na-ahụ dịka ọgbatauhie n'ọkpọ, Joshua sị na ọ bụ Tyson Fury na-echu ya ụra. O kwuru na eneweghị onye nwere ike ị ma ihe Fury bu n'obi nke mere na ọ bụ ezigbo nsogbu nye ya. Kama Joshua ekwuola na ọ dị njikere ka ya na Tyson Fury lụọ ọgụ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48865189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48865189,Nwodo sị ka otu ndị ugwu sị ka eweghachite Ruga gbara ọgwụ ha ṅụọ,"Otu jikọta ndị Igbo bụ Ohaneze ndị Igbo ekwuola na okwu otu akpọrọ ""Coalition of Northern Groups"" kwuru banyere atụmatụ Ruga adabaghi ma ncha.","Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru nke ka ọ na asa okwu Abdulazeez Suleman kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụko mere ụnyaahụ bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Juun. Na mkparịtaụka ahụ, Maazị Suleman nyere gọọmentị etiti abali 30 iji weghachite atụmatụ Ruga. Maazị Nwodo sị na jọgbụrụ udele sigbuo nkakwụ makana o megidere iwu. Ọ sị, ""Suleman gara n'ihu tie aka na ha ga-achupu ndị Ọdịda Anyanwu bi n'Ugwu. Okwu a dị ka okwu ndị ntoroọbịa ugwu kwuru mgbe ha sị na ha ga-achụpụ ndị ndịda Naịjirịa bi n'ugwu afọ abụọ gara aga."" Ndị Fulani na-achị ehi egbuola ihe karịrị mmadụ otu nari n' izu atọ gara aga Nnia Nwodo sị na Ohaneze anaghi egbochi ndị mmadụ isi Ugwu nata, ma ya bụru na ndị Ugwu bi Ọwụwa Anyanwụ ga-ala kwu. Ukwu Ruga malitere ka gọọmentị etiti kwuru na ọ ga amalite atụmatu ahu iji kwụsịlata esemokwu na-ada n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọkọ ugbo n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa. Agbanyeghị na gọọmentị sị na atụmatụ a abụghi ihe mmmmmmanye, ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị si ndịda Naịjirịa si na ha achọghị ya. Gọọmentị sị na ha wezugara atụmatụ ahụ maka adabanyeghị n'atụmatụ ọzọ akpọrọ ""National Livestock Transformation Plan"" (NLTP) bụ nke Osote Onyeisiala Osinbajo na-ahazị. Akwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo" egwuregwu-47928993,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47928993,Watford vs Arsenal: Ihe a ọ bụ ụkwụ nnama ji aga Aba?,Asọmpi Watford na Arsenal taa agbaghị aka ebe ọnwụ gbuoro Arsenal ka a rụrụ aka.,"Watford ebee Ngwa ngwa a malitechara bọọlụ, na nkeji iri, ka nwaamadị Arsenal ji eme ọnụ bụ Pierre-Emerick Aubameyang, sọkanyere goolu mechara bụrụ naanị aka ahịa a gbara n'egwuregwu a. Ochegoolu ndị Watford bụ Ben Foster ji aka ya doziere Aubameyang nri chinyere a ka ọ nọ na-egbu oge ịnara bọọlụ a gbaalara ya azụ, mere ka Aubameyang fere ka egbe fekpuo ya na mpio. Na-erughi otu nkeji e mewachara ndị Watford obi, Troy Deeney nke Watford ejiri aka ya ritere onwe ya mpempe akwụ uhie ka o ji aka kpọọ Lucas Torreira n'ihu, mere ka a chụpụ ya n'ọgbọegwuregwu. Nchụpụ a mere ka Watford nwee naanị mmadụ iri n'ọgbọegwuregwu ahụ, nke belatara ike ha. Watford gbara Arsenal jaajaa, mana taa abụghị ụbọchị ha. Mana mmeri a Arsenal meriri nwereike inye ha ohere ịma ma ha a ga-eso zọọ ""egwu ndị ọ kara obi"" ga-eso agba asọmpi Champions League nke afọ na-abịa. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmeri a Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-48156337,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48156337,"Arsenal vs Brighton: ""Top 4"" akwaala Arsenal etu ọ kwara Man Utd?","Arsenal nọzị n'ọnọdụ ""agba ekpere chi"" ka ha na-eche ịma ma asọmpi Champions League nke afọ na-abịa ọ kwaala ha n'ezie.","Ka ọ dị ugbua, enweghi ebe ha ji azụ aga, mana ha nwere obere olileanya ma ọ bụrụ na ha nwee ike merie asọmpi Europa League. Ụzọ ọzọ bụ ma ọ bụrụ na ha merie Burnley na Premier League, ma banye chaplet ha na mmiri ka Everton gwọọ Tottenham ara a gwọrọ ibe ha. Ndị Arsenal nweburu olileanya imeri egwuregwu a ka Pierre Emerick Aubameyang bu ụzọ jiri penariti gbanye goolu na nkeji itoolu e ji bido bọọlụ. Glenn Murray jikwa penariti sata goolu nke ha na nkeji 61. Otu abụọ a, ọkachasị Brighton gbara elu gbaa ala, mana goolu ekweghi aba. Pascal Gross nke Brighton nwetara ohere iji nri chinyere gbarie neetị Leno, mana ọ gbafuru ya. Ka ọ dị ugbua, ndị Arsenal na-ekpe ekpere imeri ma ruo Champions League, makana ọ dị ka ụgbọ ahụ nọ na ""kwara pụ, kwara pụ"". Cheta na nke a ga-abụ asọmpị ikpeazụ Petr Cech na Aaron Ramsey ga agbara otu Arsenal dịka ha na-apụ na ngwụcha afọ a." afirika-48634017,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48634017,Inec Server: 'Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ 'card reader' niile otu ebe na kọmputa',"Onyeozi Inec bụ Festus Okoye ka an-ekwusi ike na ndị ụlọọrụ ahụ enweghị ""Server"" bụ nke nyere ha ohere izipụ mpụtara ntuliaka 2019.","Okoye si na iwu Naịjirịa enyeghị ha ohere ime otu ahụ. N'olu ya, ""iwu Naịjrịa nyere ikike iburu mpụtara ntuliaka niile nke dị na ""fọm̀ EC8A"" n'aka buga ebe a ga-egbokọba ha na wọdụ."" ""Iwu Naịjirịa anyị ji mee ya bụ ntuliaka amaghị iji igwe kọmpụta zipu ozi ọbụla."" Ndị 'Collation Officer' ka ọ bụ ọrụ ha iburu akwụkwọ ndị a n'aka buga ebe a chọrọ ya. ""O nweghị mgbe anyị jiri igwe kọmpụta zipụ mpụtara ntuliaka."" Okoye kwetara na ndị debere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka 2019 niile dị na igwe kọmputa, na enyere ndị otu pati niile aha ndị a. Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka O kwusiri ike na ""ọ bụ naanị mgbe eji igwe kọmuta tụọ vootu ka a ga-asi na ihe dị na sava"". Ọ sị na ya amaghị maka mpụtara ntulika 2019 ị dị na sava ọbụla. N'otu aka ahụ BBC jụkwara onye ọrụ kọmpụta ama ama bụ Emeka Unachukwu gịnị bụ 'server'? Unachukwu sị na ""'Server' bụ kọmpụta na-ejikọ kọmpụta ndị ọzọ ọnụ eji edewe mkpụrụozi dị iche iche"". O kwuru na Inec nwere ike ikwu na ha enweghị 'server' maka na o nwere ụlọọrụ ọzọ na e jidere ha mkpụrụozi mana ọ bụghị eziokwu na ha enweghị server' ebe e nwere mkpụrụozi. Ọ sị na Intanet nwere 'server' nke ya ebe ọtụtụ mmadụ na-edowe ozi ha. Unachukwu sị na ""Inec agaghị asị na ha enweghị sava maka na ha nwere ebe ha na edowe mkpụrụozi bụ data. Ha nwere ike kpọ nke a ""data base"" mana ihe ọ bụ bụ sava maka na kọmpụta ahụ jikoro ndị ọzọ ọnụ bụ ndị nke nwere ike ịdọro ọzi maọbụ zite ọzi na ya"". Ọ sị na ọhịara ahụ Inec isi na ha enweghị server'. Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka Unachukwu kwuru na ọ bụrụgodi na a tụrụ vootu n'aka buru ya n'aka buga ebe a gụrụ ya, na Inec ga-etinyekwa ya na ya bụ 'server'. Mana ha nwere ike ikwu na ha etinyebeghị mpụtara 2019 na ya bụ 'server' nke gosiri na ha arụchabeghị ọrụ ha. Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiri anyị Gịnị bụ 'democracy' in asụsụ Igbo?" afirika-55907993,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55907993,Igbo Inheritance: 'Ụmụ nwanne m ndị nwoke wekọọrọ ihe niile mgbe nna anyị nwụrụ',"Mgbe nna Onyinye Igwe nwụrụ n'afọ abụọ gara aga, ndụ malitere ịhịara ya ahụ n'agbanyeghị na nna ya bụ ọgaranya.","Nna ya ekeghị ekpe tupu ọ nwụọ nke mere na o nweghi ụzọ ewepụtara ike akụ ya n'ebe ụmụ ya nọ. N'agbanyeghị na ọ bụ nwa mbụ, Onyinye na ụmụ nwanne ya nwaanyị ise eketeghi ihe ọbụla - ihe niile gara n'aka nwoke atọ nọ n'ezinaụlọ ahụ dịka omenala Igbo si kwuo. ""Ha gwara anyị na abyị bụ nwaanyị nke mere na o nweghi ihe anyị ga-eketa maka na anyị ga-alụ di. N'ihi na ọ bụ omenala, anyị alụsoghị ha ọgụ"" ka ọ gwara BBC N'ihi nke a ọ kwụsịrị ịgụ akwụkwọ siwezie nri n'obodo Abagana dị n'Anambra steeti. ""Ebe a ụmụ nwoke na-ewere ihe niile"" Oscar Nonso ketara ụlọ nna ya ebe nwanne ya nwaanyị enwetaghị ihe ọbụla Onye ọzọ m hụkwara bụ Evelyn Onyenọkwalu - nwa mbụ na ezinaụlọ ụmụ anọ. Mgbe nna ya nwụrụ nwanne ya nwoke bụ ọdụdụ nwa ketara ihe niile. ""Mmadụ niile tinyere ọnụ tupu o kwe nye m otu imeụlọ n'ụlọ ahụ ma gwa m sị m akpọchila ụzọ"" Nwanne ya nwoke Oscar Nonso bụ otiegwu na-azụ ọkụkọ na mbara ahụ kwuru na ọ gbasoro omenala nke mere na aka ya dị ọcha. ""Ị na-ekwu na ụmụnwaanyị esoghị n'ihe a na-eme"" Iwu ala Naịjirịa megidere ikewapụ nwaanyị n'oke nna ya mana ndị Igbo jisi omenala ha ike. N'ọtụtụ ezinaụlọ akụ nna hapụrụ were nwụọ bụ ụmụ ya ndị nwoke na-eke ya. Ụfọdụ ụmụnwaanyị bụ ngwa nne ha bụ naanị oke ha na-eketa n'agụnyeghị ala na ụlọ. Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị Ndị Igbo kwenyere na nwaanyị anaghị eketa ala n'ihi na ha ga-ahapụ ezinaụlọ ha lụọ di. E nwekeara ụjọ na di nwaanyị ahụ nwereike isi n'alụmdinanwunye weghara akụnaụba ezinaụlọ ọzọ. Ụlọ dị n'ala obi bụ nke ewepụrụiche maka naanị ụmụnwoke site na ndị kachasị tọọ ibe ha - nke bidoro n'oge gboo mgbe ndị Igbo nwere ihe a na-akpọ 'obi' maọbụ 'ogbiti'. Mgbe nwoke nwe ụlọ nwụrụ, 'ogbiti' ahụ na ihe niile eji agọ ọfọ dị ya n'ime na-aga n'aka nwa ya nwoke nke mbụ maọbụ nwoke ọzọ n'ezinaụlọ ahụ maọbụrụ na ọ mụtaghị nwoke. Mana ọ bụghị ụmụnwaanyị niile na-ekwenyezi n'omenala a. Otu ikpe ekpere n'afọ iri abụo pụtara na mmeri maka otu nwaanyị kpụpụrụ ezinaụlọ ya ụlọikpe maka ikewapụ ya n'akụ nna ya. Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kwuru na o mejọrọ iwu ịkewapụ ụmụ nwaanyị n'akụ nna ha 'n'agbanyeghị etu ọbụla e si mụ ha'. Mana ihe agbanwechabeghị kemgbe afọ 2014 ekpechara ikpe ahụ. Egodi Igwe ekpeela ọtụtụ ikpe ebe akwụsịrị nwaanyị iketa oke na be nna ya Egodi Igwe (abụghị nwanne Onyinye Igwe) nke Women Aid Collective (Wacol) bụ ụlọọrụ enyemaka na-enyere ụmụnwaanyị ekewapụrụ n'akụ nna ha enyemaka ịga ụlọikpe kwuru na ụlọọrụ ya na-enye ụmụnwaanyị puku kwuru aka kwa afọ. ""Omenala bụ ihe na-eme ka ụdịrị agwa ọjọọ a na-abawanye n'obodo dị iche iche"" ""Ọ bụrụ na ị na-agwa nwaanyị na o nweghi oke na akụ nne na nna ya, ị na-agwa ya na o soghị n'ezinaụlọo ahụ"" ka o kwuru ""Nwoke na nwaanyị dị nhatanha"" N'agbanyeghị na nke a bụ omenala a ma ama, ọtụtụ obodo akwụsịla ya. Igwe Godwin Ecko bụ otu n'ime ndị na-achị kwụsịrị ya n'obodo ya bụ Ihe dị n'Enugwu steeti. Igwe Godwin Ecko bụ otu n'ime ndị eze nwere ụmụ nwaanyị so ya achị Anyị kwenyere na nwoke na nwaanyị nhatanha, ị napụ ha ụfọdụ ihe adịghị mma"" Ọ bụ mgbe ọ ghọrọ eze n'afọ 1993 ka ihe jiri gbanwe, akwụsị ụdịrị ihe ahụ. ""Ndị mmadụ kwuru na m ga-enweta nsogbu maka ịgbanwe omenala mana o nweghi ihe mere m"" ka o kwuru. ""Mụ na ụmụnwoke ndị nwoke agaghị ese okwu"" Ndị na-azọ oke ruru mmadụ kwuru na nke a bụ otu ụzọ e si akpa oke n'etiti nwoke na nwaanyị nke gụnyere ịkpụ isi nwaanyị ajadu nakwa ibi nwaanyị ugwu. Ọ bụ naanị ụmụ nwoke nwere ịke iketa ụlọ na ala ""Dịka ụdịrị ihe a na-efegharị, ọ ga-adị mma ka ụmụ nwoke kpachara anya ịhụ na ihe a emeghị ezinaụlọ ha ma ha nwụọ"" ka Egodi Igwe kwuru. O chere na enwereike ịme nke a site n'ike ekpe maọbụ ịgwa ndị ezinaụlọ gị etụ i si chọọ ka ekee akụ gị mgbe ị nwụrụ. Onyinye Igwe kwetara nke a Ọ sị na o bughi ihe ọbụla n'obi ebe ụmụ nwanne ya nwoke nọ ma kwuo na ọ gaghị a ga ụlọikpe maka ya ""Ọ bụrụ na nna m kere ekpe mgbe ọ ka dị ndụ, ihe agaghị adị etu a. ""Mụ na ụmụnwanne m nwoke agaghị eseokwu, ha ka bụ ọbara m"" ka o kwuru." mba-uba-57138135,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-57138135,"WHO ekwuola na ịrụte ọrụ aka na-edula mmadụ 745,000 mmụọ kwa afọ dịka nchọpụta gosiri","Ịrụte ọrụ aka na-egbu puku kwuru puku mmadụ kwa afọ, dịka ngalaba ahụike mbaụwa bụ ""World Health Organization"" (WHO) si kwuo.","Nchọpụta mbụ a na-eme n'ụwa gbasara ya gosiri na mmadụ 745,000 nwụrụ n'afọ 2016 site n'ọrịa mkpọnwụahụ nakwa ọrịa obi nke ịrụ ọrụ ọtụtụ awa butere. Nchọpụta a gosiri na ihe a kacha emetụta ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ Eshia nakwa Ndịda-Anyanwụ Pasifik. WHO kwuru na ihe a nwereike ịkawanye njọ n'ihi mkpamkpa coronavirus. Nchọpụta a e mere gosiri na ịrụ ọrụ ihe ruru awa 55 maọbụ karịa n'otu izu butere mmadụ iji pasentị 35 (35%) nwee ike ibute ọrịa mkpọnwụ ahụ, ma jirikwa pasentị 17 (17%) nwee ike ime ka mmadụ si n'ọrịa obi nwụọ. Nke a bụ iji tụnyere ịrụ ọrụ awa 35 ruo 40 n'otu izu. Nchọpụta a nke ngalaba International Labour Organization (ILO) so mee, gosikwara na ihe ruru atọ n'ime anọ bụ mmadụ ole nwụrụ n'ihi ịrụ ọrụ ọtụtụ awa bụ ụmụnwoke katatụrụla ahụ maọbụ ndị merela okenye. Ọtụtụ mgbe, ọnwụ ndị a na-abịa mgbe onye ahụ bitetụrụla ndụ, ụfọdụ oge mgbe ọtụtụ afọ gachara, karịa mgbe onye ahụ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ ahụ. Akụkọ ga-amasị gị... Career Choice: Ọrụ Bekee na ịrụrụ onwe gị ọrụ, kedụ nke na-amasị gị? Dịka nchọpụta a agụnyeghi oge mkpamkpa ọrịa coronavirus a, ndị ọrụ WHO kwuru na etu ọtụtụ ndị mmadụ si malite ịrụ ọrụ n'ebe ọbụla ha nọ karịa ịbata n'ụlọọrụ nakwa ndakpọ akụnaụba, nwereike iso n'etu ihe ize ndụ ịrụte ọrụ aka si arị elu. ""Anyị nwere ihe mgbaama gosiri na mgbe mba dị iche iche banyere na mgbachi obodo, awa ole e ji arụ ọrụ ji ihe ruru pasentị iri (10%) rịgoo,"" ka Frank Pega bụ onye ọrụ WHO kwuru. Nchọpụta ahụ kwuru na ịrụ ọrụ ọtụtụ awa so bute ụfọdụ nrịanrịa si n'ịrụ ọrụ, nke mere ya nsogbu ọrịa si n'ọrụ kacha. WHO na-atụ atụmatụ ka ndị isi ụlọọrụ buru nke a n'uche mgbe ha na-enyocha ihe ndị nwereike ibutere ndị na-arụrụ ha ọrụ nsogbu ahụike. Pega kwuru sị na ikwu sị na 'ihe a bụ awa ole onye ga na-arụ' ga-abara ndị ọrụ uru dịka a hụrụ na ọ na-akwalite ntinye uchu n'ọrụ. ""Ọ bụ atụmatụ gosiri amamihe na ebulighi awa ole mmadụ ji arụ ọrụ n'oge akụnaụba ọtụtụ mba dị na nsogbu."" May Day 2020: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19" afirika-51596157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51596157,Nigerian Foods: Onye afọ nri! Lekwa ihe mere ụtọ agwa ji aba n'ụmị,"Onye ọbụla nrị na-amasị ma na agwa bụ asa na nrị. Eziokwu agwa bụrụ nwaanyị ọ ga-abụ asa dị egwu. Otụtụ nrị eji agwa esi nke mere na ị jụọ mụ, m ga-asị gi na agwa bụ oyoyo na nrị.","Ndị afọ nrị nille ma na agwa na-edozi ahụ ma na enyere aka n'ihe gbasara ahụisiike. O nweghị etu ọbụla ị ga-esi sie agwa ka ọ hapụ ịtọwa ntị. Ị ma na e nwereike ighe agwa eghe, ma ọ bụ kwọchaa ya ka ọ bụrụ flawa e jizi eme ihe dị iche iche. Ngwa weta oche, nọrọ ọdụ ka-anyị zọpụ njem ka ị mara ihe agwa ji bụrụ sawam maka nri oriri. Gịnị ka agwa na-enye n'ahụ? Lekwa etu agwa na anụ ọkụkụ siri dịka dị na nwunye Onye ọbụla na-eri agwa nke ọma na-agbatị ndụ ya. Nkea bụ maka na ihe agwa nwere ọtụtụ ihe dị n'ime ya na-edozi ahụ. Ụfọdụ n'ime ihe ndịa na-edozi ahụ gunyere Kalori, purotin, abụba, Kọpa, zịnkị, potashium, Vịtamin B6 na ọtụtụ ihe ndị ọzo na-edozi ahụ. Mana n'ụzọ ọga-adị mfe, lekwa etu agwa si edozi ahụ Agwa na-enyere aka maka ọnye chọrọ ịta ahụ. Nkea bụ maka na onweghị oke abụba nke na-ebute ibu. Nke abụọ bụ na agwa na-enyere aka maka mgbarị nrị maka na o nwere fịba. Ọzọ bụkwa na ọ na-edozi obi maka na ọnweghị oke abụba nke mere na onye na-erikarị ya anaghị arịa ọrịa obi. Lee ụzọ dị iche iche e si esi agwa Agwa agwọrọ agwọ Agwa bụ nrị na-amasị ndị Igbo.Ụzọ esi eri agwa ndị mmadụ kachamara bụ agwa agwọrọ agwọ. Enwere ike ịji ọtụtụ ihe ndị ọzọ rie agwa mana ọtụtụ n'ime nri ndịa na-ebido n'agwa agwọrọ agwọ. Ufọdụ na-akpo agwa na achịcha bụ kwa ezigbo enyi Ihe eji esi agwa agwọrọ agwọ Negodi agwa agwọrọ agwọ nwere 'Visa' Etu e si esi ya Akara Akara, achịcha na akamụ na-aga serere A si na nwata na-ata akara na-ata ego ya. Echetara m mgbe mmadu bụ nwata ọ na-abụkari ụtụtụ ụbọchị sunde ka a na-enye anyị akara. Akara na-akacha atọ ụtọ mgbe ọ di ọkụ ọkachasị mgbe ị ji achịcha ata ya nke ụfodụ ndị na-akpọ 'Burger' ndị be anyị . Biko arachakwala ekwentị gị Ufodu na eji kwa akamụ ma ọ bụ garị erị akara. Mana kedu etu e si esi akara? Maị Maị Hewu! Nke a na-atọba n'ụmị. Maị maị bụ nri mmadụ nwere ike iri mgbe ọbụla nakwa ebe ọbụla. Ị nwere ike iji ihe gunyere akwụkwọ nri, komkom igwe, komkom mmiri ara ehi, 'Foil' were kechie ya. Ụfọdụ ndị dọkịta ahụike na-ekwu na akpa wakịrị wakịrị nke a na-akpọ 'Santana' adịghị mma iji kechie ya. Ị chọrọzia ka Maị maị gị bụru oyoyo, i nwereike itinye ya azu ma ọ bụ akwa e siri esi. Moimoi na akwa esiri esi bụ erichaa amịchaa aka Akamụ na garị na moimoi gbara ndụ, maka ị were ha rie moimoi ịghọta na ụtọ azu dị n'isi ya. Ụfọdụ na-eji kwa achịcha eri moimoi mana otu ọbụla, moimoi na-atọ ụtọ pụru iche. Etu e si esi Mọịmọị Mọịmọị na Kụstadị,Akamụ, achịcha ma ọ bụ oot na-agakọ nke ọma Agwa asụrụ asụ Ọ bụ stu ya mere ka agwa a pụọ iche Agwa asụrụ asu kacha baa ụba na mpaghara owụwa anyanwụ Naijirịa. Ọ na-abụ a sụ chaa agwa esiri esi ewere stụ a na akpo 'Ewa Agoyin' were rie ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ihe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari n'ahụ gị" afirika-44156521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44156521,Anyi anaghi atu egwu Okorocha - ndị nkewa APC Imo,Esemokwu onye ga abụ onye ga-anọchịte anya ndị APC Imo dịka gọvanọ na ntụlịaka nke 2019 ka na-adakwa.,"Ihe ndị ""Restoration Group"" kwuru Cheta na esemokwu a pụtara ihe n'ọnwa a, mgbe ha mere nhazi akpọrọ ""Congress"" a ga-eji họpụta onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa gọvanọ. Taa, otu n'ime ndị kewapụtara n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC kpọrọ ndị ntaakụkọ n'isi ụlọọrụ ha maka ị kọwa echiche ha n'esomokwu nke di n'etiti ndị APC nke Imo steeti.N'ọnụ okwu TOE Ekechi bụ onụ na-ekwuchitere otu a, ha na-ebo gọvanọ Okorocha ebubo na o nupuru iwu ji patu ha isi ọtụtụ oge. Ndị ""Restoration Group"" si na ha ga alaghachị Imo maka ntụlịaka Ha kwukwara na Okorocha a na-abataghị ntuliaka emere n'Imo steeti maka na ọ na-agba mbọ ihụ na ọgọ ya nwoke were ọchịchị gọvanọ n'afọ 2019. Otu a na-ekwu kwa na Okorocha ekwughi eziokwu mgbe ọkpọro ndị mmadụ aha na ha esoghi na pati. BBC Igbo jụrụ onye ode akwụkwọ Gọvanọ Okorocha bụ Sam Onwuemeodo ihe ochere banyere n'ihe niile ndị ""Restoration Group"" na-ekwu mana ọ gwara anyị na-onweghị ihe ọ ga-ekwu banyere ha maka n'uche ya, ha emechala ihe ha nwereike ime. ""Ike agwụla ha,"" Onwuemeodo gwara anyị.Ekechi na ndị otu ya kwuru na ha ga-abata Imo steeti maka ntụlịaka ga-eme echi bụ ụbọchi iri na asatọ nke ọnwa Mee. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45301749,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45301749,Atọghapụla ụmụnwaanyị IPOB n'Owere,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na atọghapụla ụmụnwaanyị IPOB anwụchiri n'owerre n'izuụka gara aga maka ngagharị iwe ka atọghapụ Nnamdi Kanu.,"Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa. Otu onye ọkaiwu nọ ebe ihe a mere kwuru na ọbụ ụlọịkpe n'Owerre nyere iwu ka atọghapụ ụmụnwaanyị ahụ. Ndị Amnesty International tịnyere ọnụ n'okwu a ụnyaahụ mgbe ha boro gọọmentị Naịjirịa ebubo ị nwụchi ya bụ ụmụnwaanyị n'ụzọ ezighi ezi. End of Twitter post, 1 Kingsley Moghalu bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, gara n'ụlọ mkpọrọ ebe e ji ụmụnwaanyị a n'Owere, tinyere ọnụ ya n'elu Twitter. O kwuru sị na onye ọbụla kwesịrị inwe ikike ime maọbụ ikwu ihe masịrị ya na Naịjirịa. N'otu aka ahụ, Sam Amadi bụ otu na-onye azọ ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti n'afọ 2019, tinyere ọnụ n'okwu a sị: ""O meela! Ndị nne anyị na ụmụnne ụmụnwaanyị anyị apụtala."" Cheta na Amadi so na ndị gara n'ụlọ mkpọrọ ịhụ na a tọghapụrụ ụmụnwaanyị a." afirika-56496963,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56496963,South East Security : Onitsha Ado Vigilante Unit na ihe i kwesịrị ịma maka ya,Obi nke Onitsha bụ Igwe Nnaemeka Achebe nọọrọ n'ọnwa Febụwarị afọ 2021 kpuhee otu nchekwa ọhụrụ nke obodo ahụ a kpọrọ 'Onitsha Ado N'Idu Vigilante Unit'.,"Mgbe a na-edu ndị otu nchekwa Onitsha Ado n'iyi ọrụ E hiwere otu nchekwa iji gbaa mgba megide mpụ, ohi nakwa ihe ndị arụ ndị ọzọ metụtara nchekwa n'obodo Onịcha na gburugburu ya. Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke E bunyere ha ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ichekwa obodo ọfụma. Ihe i kwesịrị ịma maka 'Onitsha Ado N'Idu Vigilante Unit' Igwe Nnaemeka Achebe ka ọ na-edu ndị otu nchekwa Onitsha Ado n'iyi ọrụ Ihe na-eso nhiwe otu nchekwa Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob etinyela ọnụ n'okwu ihiwe otu nchekwa Onitsha Ado Vigilante Unit. Kanu sị ka Igwe Achebe ekwela ka e were ọkwa ya bute nsogbu nye ndị Eastern Security Network bụ nke Kanu n'onwe ya hiwere. Ọ sị ma ọ bụghị ya na Igwe Achebe na ndị otu ya ga-ebe akwa. Mana ndịisi otu a e meela ka ọ ha mata na ihe e jiri hiwe ha bụ maka ọdịmm ndị obodo Onitsha na gburugburu ya. Na o nweghi ihe ọzọ ma ọ bụghị naanị ibuagha megide mpụ, ohi, ntọrị n'oge a ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ n'Ọwụwa Anyanwụ." 49000705,https://www.bbc.com/igbo/49000705,"""El Chapo"" ga-atakute ya kọnkịrị n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe ọ ga-anwụ","Ndị ụlọikpe mba Amerịka ekwuola ihe ga-eme Joaquin Guzman eji ""El Chapo"" mara.","""El Chapo"" Ulọikpe dị na mba Amerịka atụọla ya nga mkpụrụ ọka ogologo ndụ ya niile ma tinyekwa ya jara afọ iri atọ maka ire ọgwụ ike. A mara ya ikpe ụzọ iri gụnyekwara ịda iwu gbasara ibupu nnukwu ego. El Chapo kwuru na ikpe e kpere ya ezighị ezi. Cheta na ejidere ya ma tụo ya nga ugboro abụọ na Mexico ma ọ mipuru na nga gbafuo tụpụ nke igbazu a nwudere ya. Ohaneze asahachila ndị NEF Ohaneze Ndị Ohaneze, Ipob na otu Njikọ Igbo efufeela isi sị na onweghị ndị ha sị ka ha kwara si ala Igbo pụọ. Ihe butere okwu a bụ ọsisa ha n'ebubo ndị otu Northern Elders Forum (NEF) na otu 'Coalition of the Northern Groups' boro ndị ndu ndịda Naịjiria gụnyere ndị gọvanọ. Ebubo a n'ekwu na ha majara ndị Fulani ọchịehi sị na ha ga-ebuso ha agha. Ụlọomeiwu anabatala okaikpe kachasi ohụrụ Tanko Mohammed Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ahọpụtala Tanko Mohammed dị afọ iri isii na isii dịka Onye ọkaikpe kachasị na Naijirịa. Nke a pụtara ihe dịka ụfọdụ ndị omeiwu gbachara ya ajụjụ ọnụ nke were otu awa na ọkara. Newcastle ataala igu n'aka Wolves FC Diogo Jota na-agbara ndị Wolves FC Ndị otu bọọlụ Wolves FC ejirila ọkpụ goolu anọ asataghị ma otu were zọọ ndị Newcastle United Ojukwu. Nkea na-eme dịka ha na-anabata Steve Bruce dịka onyendu ndị otu bọọlụ Newcastle. Ihe Buhari kwuru maka ụgwọ opekatampe Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ka e bulie ụgwọọnwa opekatampe n'ọnwa Eprel afọ a Obi na-atọ ndị ọrụ gọọmentị etiti rịkpọọ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari nyerela iwu ka a malite ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ nke pụtara puku naịra iri atọ. Mana iwu a ga-emetụta sọọsọ ndị ụgwọọnwa ha na-erubughị puku naịra iri atọ mgbe gara aga, ebe mkparịtaụka ka na-aga n'ihu maka nke ndị ọzọ. 'Ndị Fulani ọchiehi lọtawanu o'! Ihe gbasara ndị Fulanị ọchịehi bụzị okwu a kpụ n'ọnụ ugbua Otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu akpọọla oku ka ndị ọchịehi niile nọ na ndịnda anyanwụ lọghachi Ugwu Awụsa na-egbughi oge. Ha kwuru nke a dịka ha mechara ọgbakọ nke ndị 'Northern Elders' Forum' n'ụbọchị Tuuzdee. Onyeisi otu ahụ bụ Ango Abdullahi kwuru na ndị be ha na-achị ehi ejizighị ndụ ha n'aka n'ihi mmaja ndị ndu ndị Ọdịda-Anyanwụ na-amaja ha. CAN agọlahụna ndị otu ha Biodun Fatoyinbo kwuru na ọwakpotubeghị nwaanyị na ndụ ya Otu 'Christian Association of Nigeria (CAN) agọọrọla aka na ụkwụ ha banyere ụfọdụ ndị otu ha gara n'ụlọụka COZA ụbọchị ụka gara aga iji kwado ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo bụ onye a na-ebo ebubo na ọ wakporo nwata nwaanyị n'ike. O kwuru ọha otu CAN bụ Kwamkur Vondip kwuru na ọ bụghị ha zipuru ndị gara ije ahụ kama na ha gara n'isi onwe ha. Iwu amaghị Eze Alejandro Toledo bụ onyeisi mba Peru bido n'afọ 2001 ruo afọ 2006 N'ofesi, e jichiela onye bụbu onyeisiala mba Peru, Alejandro Toledo na mba America dịka ala ya rịọrọ n' arịrịọ maka ebubo nrụrụaka. Mana Toledo na-agọ na ya anaghị ngarị ruru nde dọla iri abụọ n'aka ụlọọrụ Brazil na-ewu ihe owuwu. Agbaa nchi alaa nta Ndị otu Super Eagles na-akwado maka asọmpi ikpeazụ ha na Afcon 2019 N'egwuregwu, ndi otu Super Eagles ga-ezute ndị ogbo ha ndị mba Tunisia taa iji mara ndị ga-erite ọla nchara n' asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a. Asọmpi a ga-atajiri n'elekere asatọ nke abalị taa ebe ụmụ Naijiria ga-amata ma dika elu erughi ha aka, ala a ga-erukwa ha aka. Akụkọ ga-amasị gị: Morocco nwa Maduka: Prof Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ" media-49471008,https://www.bbc.com/igbo/media-49471008,Buhari in Japan: Ipob emeghi 'pịm' ka Buhari wuchiri Japan,"Ndị isiala Naịjirịa ekwuola na o nweghi ihe jikọrọ ndị Ipob na njem onyeisiala Naịjirịa ka o wuchiri na Yokohama na mba Japan, n'ụbọchị Monde.","Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ puruiche gbasara mgbasa ozi nke onyeisiala Buhari gwara ndị Naịjirịa ka ha gba ndị Ipob nkịtị maka ihe onyoonyo ụgha ebe ha gosiri ebe ha na-awakpo onyeisiala Naịjirịa. End of Twitter post, 1 Dịka edemede Femi Adesina si kwuo na ""akụkọ ụgha a bụ aka ọrụ ndị kpọrọ mmadụ asị na-amaghị na ndị Naịjirịa ahapụla ha kamgbe"". Onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari gara Japan iji sonye na nzụkọ 'International Conference on African Development' nke asaa a na-akpọ TICAD7 n'chafụ. Nzụkọ a na-eme na Tokyo. Femi Adesina kwuru na nzukọ a ga-ebido n'ụbọchị 28 ruo 30 n'ọnwa Ọgọst, 2019, nke isiokwu ya ga-abụ ""Afrịka na Yokohama, nkekọrịta mmasị ọdịnihu"" Cheta na nke a ga-abụ nzukọ nke abụọ onyeisiala Naịjirịa ga-eso mee, dịka o sonyere na nke e mere n'afọ 2016 na mba Kenya. Ọ sịkwa na olileanya ha bụ na nzukọ a ga-ebutere Naịjirịa ụlọọrụ ndị na-etinye ego n'azụmahịa. Otu egwuregwu ụmụnwaanyị na-erubeghi afọ iri abụọ (U-20) ejirila goolu gbajuo Ọljiria afọ Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjiria ndị na-erubeghi afọ iri abụọ (U-20) ejirila goolu gbajuo Ọljiria afọ. Otu a akpọrọ Falconets, ji goolu atọ a na-asataghị ma otu merie n'asọmpi African Games a na-eme na mba Moroko. Nke a bụ mbụ otu egwu bọọlụ Naịjirịa na-eru agba ngwụcha n'asọmpi a kemgbe 2007. Kaduna steeti ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ha ga-amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe puku iri atọ (N30,000) site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, 2019. Muyiwa Adekeye bụ onye ndụmọdụ pụrụiche n'ihe gbasara mgbasaozi na nrụrịtaụka nye Gọvanọ Nasir el-Rufai, kwuru nke a ka e mechara nzukọ ndị ọchịchị steeti ahụ, nke osote Gọvanọ Hadiza Balarabe nọ n'isi ya. O kwuru na ha kwekọrịtara ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ a nakwa ụgwọ ndị ọzọ nye ndị ọrụ Bekee site n'ọnwa Septemba. Anyị akụtughi ụlọalakụba - Wike Ndị bi n'agbataobi ahụ gwara BBC na ọ bụ n'izu gara aga ka a kwaturu ụlọ ahụ Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike, agọrọla ụkwụ na aka ya n'ebubo na gọọmentị kuturu otu ụlọalakụba na steeti ahụ. Ọ gwara ndị ntaakụkọ na gọomentị enyebuola iwu ka a ghara ịrụ ụlọ n'ala ahụ, mana ndị na-arụ ụlọ ahụ kpụpụrụ gọọmentị ụlọikpe, ebe gọọmentị nọ merie ikpe ahụ. O kwuru sị ""Ọ dị egwu na ndị mmadụ ga-eche na a rụrụ ụlọalakụba, gọomentị agaa kwatuo ya"". Ọ gara n'ihu kwuo na onye sị na ọ bụ asị, na ndị alakụba pụta bịa tụọ aka ebe ha rụrụ ụlọekpere ha sị na gọọmentị kwaturu. Interpol ọ ga-enyere Naịjiria aka? Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa akpọkuola ndị Interpol bụ ndị uweojii mba ụwa niile, ka ha gbatara ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ọsọ enyemaka iji chọpụta ụzọ e si ebubata ngwa agha iwu machiri. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na mba ha na China ga-amalitekwa nkata ha gbasara azụmahịa ọzọ. Cheta na Trump kwuburu na ọ ga-agwa ụlọorụ ndị Amerịka nọ na mba China ka ha kwakọrọ ihe ha lọghachite, n'izu gara aga, dịka China kwuru na ha ga-etinyekwu ego n'ihe ndị Amerịka na-arụpụta na mba ha. Gịnị na-afịọ n'Imo steeti? Gọọmentị Imo Steeti ekwuola na ha agaghị egbochi nnyocha ndị nchekwa nzuzo nke mba Amerịka na-eme gbasara mpụ ịntanetị nke ụfọdụ ụmụ Naijiria mere n'obodo ahụ. Nke a na-abịa dịka a chọpụtara na otu onye n'ime ndị a na-ebo ebubo iso na mpụ a bụ Chika Odionyenma, rụbuuru Emeka Ihedioha ọrụ. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Anyị agaghị egbochi nnyocha onye ọbụla aka ya dị na mpụ ịntanetị - Ihedioha Gọọmenti agaghị egbochi mba obụla ihibe iwu ha Gọomentị ga-eweputa iwu ga egbochi mpu igwe intanetị Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naijịrịa bụ Garba Shehu, ekwuola na gọomentị etiti dị njikere iwepụta iwu ga-amachi ụzọ niile ụfodụ ndị ji ebutere Naịjirịa aha ọjọọ n'ofesi. O kwuru nke a mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ maka ụmụ Naịjirịa e ji eji na mba Amerịka gbasara iji ụzọ aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego site n'Intanetị. Shehu kwuru na gọomentị na ụlọomeiwu ga-asa anya na mmiri were nyoputa mperi niile dị n'iwu Naijiria nke ndị omekome ji eme mpụ. NLC anabataghị atụmatụ gọọmentị maka ibuliụgwọ ọkụ latrik. NLC ekweghị n'atụmatụ gọọmentị ibuli ụgwọ ọkụ latrik. Otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigerian labour Congress (NLC) akagbuola atụmatụ gọọmentị ibuli ego ọkụ Latrik. Odeakwụkwọ NLC bụ Emmanuel Ugboaja, kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ma kwukwa na atụmatụ gọọmentị ire oke ha n'ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik, tiri aka na tipper bu aja ebe NLC nọ. Idemmiri na-eme ịwa na mba Sudan Idemmiri a metụtara ihe ruru mmadụ puku narị abụọ Idemmiri eriela isi mmadụ iri isii na abụọ na mba Sudan dịka ha banyere udu mmiri kemgbe ọnwa Julaị. Ndị gbatagbata nke United Nations kwuru na idemmiri a emebiela ụlọ puku iri atọ na asaa ma kwuokwa na ha na-atụ anya na mmiri ọzọ ka na-abịa. Ndị United Nations na-ekwukwa na mmiri a ga-ezogide ruo ọnwa Ọktoba. Goolu mbụ na asọmpi nke mbụ Moses Simon na-agbara otu egwu bọolụ Super Eagles nke Naijirịa Nwaafọ Naijiria bụ Moses Simon na-agbara ndị otu egwuregwu bọọlụ FC Nantes nke mba Frans sị na obi dị ya ụtọ dịka o nyere goolu ndị otu ya ji merie n'asọmpi nke mbụ ya. Simon dị afọ iri abụọ na ise batara na nkeji iri asaa na isii ma nye goolu ndị otu egwuregwu ya ji merie otu egwu bọọlụ Amiens SC. Akụko ga-amasị gị : Gee Nkeji Akụkọ nke ụtụtu a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri ga-amasị gị: Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba." afirika-48701340,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48701340,"A si ndị ọwuwa anyanwụ 'Onye kpata, o rie' aguu agaghị agu Igbo.- Ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwụ",Akụkọ dị mkpa taa Anyi nwere akuchinyere ga eme ka aguu hara igu anyị,"Ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwu asaala Onyeisiala Muhammadu Buhari okwu o kwuru ka ha gaa gbaa mbọ ịkpata ego n'aka nke ha. Onyeisiala Buhari nyere ndị gọvanọ steeti nile na Naijirịa ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ chọta atụmatụ na usoro ha ga-eji na-enweta ego na steeti ha. N'ọsisa ha, ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwu kwuru na akuchinyere dịka nnụ, ọla zinc na ntu simentị dị n'Owuwa -nyanwu, ga ezuru Ndiigbo ilekọta onwe ha ma wepu aguu. Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi kwuru nkea site n'ọnụ na ekwuru ya bu Emmanuel Uzo si ""ọ bụrụ na e nye ndị Gọvanọ ike iji aka ha chụọ ihe gbasara akụ dị n'ala, ihe gbasara mkpata na mmefu, ma ihe di n'ahia, ma ihe a na-ewepu ma nke na-abata abata, agụụ agaghi agụ ndị Ọwuwa-Anyanwụ"". Ha na-ekwukwa ka Gọọvmentị etiti kweta ka ndị steeti Ọwuwa-Anyanwụ nwee ikike i ji ihe ha nwere kpata aku ma na enyekwa Gọọmenti etiti oke ruru ha. Gaanụ chọwa ego na steeti unu Onyeisiala Buhari kwuru okwu a n'ụlọ gọọmentị n'Abuja ka ọ na-ehibe ngalaba akpọrọ ""National Economic Council"" (NEC) ga-arụ ọrụ site n'afọ 2019 ruo 2023. Ọ bụ Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo ga-anọ n'isi ngalaba a. Buhari sị ka aka ndị na-achị steeti na Naịjirịa tinye uche na nchekwa, nkuzi, ahụike nakwa ọrụ ugbo. Ọ sị: ""N'ịga n'ihu, steeti dị iche iche kwesịrị iji afọ anọ na-abịa ji chọọ ụzọ ha ga-eji nwete ego na steeti ha ma hụkwa na ọ bughi ndị mmadụ aka."" A nwuchiela nwoke ji isi mmadu agba mgbere Aka akparala otu onye ojimmaebeisi nke kwuru na ọ bụ ịgba mgbere isi mmadu ka o ji mere akaọrụ. Onyeisi ndị uweojii n' Abuja bụ Bala Ciroma kwuru nke a oge ọ na-akọpụta ihe ndị otu ya mepụtarala. Ciroma kwuru na onye omekome ahụ aha ya bụ Mustapha Aliyu, nke gbara afọ iri abụọ na abụọ, kwuru na ọ na-ere isi nwata nwoke N170,000 ebe nke nwata nwaanyị na-ada N160,000. Mgbe ndị uweojii nwụchịrị Aliyu, a hụrụ isi nwata nwoke gbara afọ atọ n'aka ya, ma ọ sịrị na o reela isi mmadụ anọ ndị ọzọ o gbuteburu. Onyeisi ndị uweojii ahụ kwuru na ha ka na-achọ onye na-azụrụ isi mmadụ ndị ahụ n'aka Aliyu. Miyetti Allah chọrọ ka e nye ha ọrụ nche Ọwụwa-Anyanwụ Nsogbu Fulani ọchịehi na ndị ọrụugbo atala isi mmadụ karịrị puku abụọ na otu afọ na ọkara gara aga Otu jịkọrọ ndị Fulani ọchịehi a kpọrọ Miyetti Allah, akpọọla oku ka ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ nye ha ikike inwe ndị ọrụ nche n'Alaigbo iji kwalite nchekwa obodo. Ọ bụ Odeakwụkwọ otu ahụ Alhaji Baba Ngelzarma kwuru nke a n'ọgbakọ nchekwa e nwere n' Enugwu ụbọchị Tọọzdee nke otu 'South East Chambers of Commerce, Mines and Agriculture,' (SECCIMA) na otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ jikọrọ aka were hiwe. Ngelzarma onye kwuru na Ndi Igbo bụ ndị na-anabata ndị mbịarambịara, sị na ""otu ndị nche ndị ntorobịa Fulani ga-enyere ndị ọrunchekwa, ndị ọrụnche agbataobi aka iji hụ n'obodo deere jii."" Ihe mere m jiri rachakwaa imi mzipụrụ-Trump Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala Mba Amerika bụ Donald Trump kwuru na ya kwụsịrị mkpebi ịgba ogbunigwe na mba Iran ka ọ fọrọ nkeji iri n'ihi na a gwara ya na ọ ga-ata isi mmadụ otu narị na iri ise. Amerika chọburu ịbọ Iran maka Igbatu ụgbọagha mba Amerịka ji eme nyocha. Cameroun abaghị AFCON maka abụbọọrụ Dịka ehihie Fraide na-ezu, ndi otu egwu bọọlụ mba Cameroun agarubeghị mba Egypt maka asọmpi Iko Afrika n'ihi na ha na-agba abụbụ ọrụ maka ụgwọ e ji ha. Gee ya n'ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị omekome na Zamfara enyela atụmatụ ha ga-esi kwụsị igbu mmadụ A na-eche na ọ bụ ndị Fulani na-akpa ike niile na-eme n'etiti Naịjirịa Ndị uweojii na-akọwa na ndị omekome na-akpa ajọ ike na Zamfara enyela ebumnuche ha maka ịkwụsị mkpamkpa ha. Onyeisi ndị uweojii na Zamfara bụ Usman Nagogo sị na otu ihe ha kpatụrụ ukwu bụ na ha chọrọ ka a kwụsị igbu ndị Fulani n'ahịa. Ọzọ bụkwa ka a hapụ ha ka ha na-aga ahịa. Usman sị na uru adịghị n'igbu otu onye Fulani ga-ebute ogbugbu mmadụ iri atọ. N'ofesi, Trump na Pompeo na Bolton, mmadụ abụọ a sị na ibuso Iran agha na-amasị Mba Amerịka amachiela ụgbọelu si mba ha ifefe n'elu ala Iran nwe. Atụmatụ a bịara ka Amerịka na-achọ ụzọ ha ga-esi saa mgbatu Iran gbaturu ụgbọelu ha n'oshimiri 'Strait of Hormuz' dị nso na mba ahụ. N'Egwuregwu, Super Falcons awụfeela ma wụbanye n'agba nke 16, dịka Thailand nyerela ha aka, tụnyere ha azụ. Ụmụagbọghọ a ga-ezute otu egwueregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Jamanị n'obodo Grenoble ụbọchị Satọde, June 22, n'agba nke abụọ asọmpi Bekee kpọrọ 2019 ""Women's World Cup"". Gee akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49065226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49065226,Rev Ikechukwu Ilo: Iwe m bụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulanị wakporo m,"Onyeisi nchụaja ụka katọlik na St. Patrick Parishi dị na Nome, n'Enugwu steeti ekwuola na ọ bụ ndị Fulani bụ ndị ya huru wakporo ha n'ụzọ.","Rev. Fr. Ikechukwu Ilo bụ onye isi nchụaja na St. Patrick Parish, Nome Fada Ilo kwuru na ọ bụ mgbe o si Enugwu alaghachị na Parishi ya ka nke a mere. Ikechukwu Ilo nọ n'ụlọọgwụ Annociation dị n'Emene Enugwu anata ọgwụgwọ ugbua kwuru na ihe na-ewute ya bụ na ndị uweojii ekwetaghị ihe ya kwuru na ọ bụ ndị Fulanị wakporo ya. Ọ sịkwa na ndị uweojii abịabeghị gbaa ya ajụjụ ọnụ ịmata ka ya bụ ọdachị sị dakwasa ya. Ọ jụrụ BBC sị ""eche m ma ọ bụ a na-eme nchọpụta, a ga jụọ ndị ihe ahụ metutara? Ma rue ugbua, onwebeghị ndị uweojii bịara ebe a juo m ajụjụ"". "" Iwe m bụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulanị wakporo m"" - Rev Ikechukwu Ilo Ikechukwu sị na gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na ndị ọzọ nwere agba na steeti abịala leta ya ma ndị uweojii abịabeghị. Ojuru BBC, ""Keduzị ka ha ga-esi nọrọ ebe ha nọ sị na ihe m kwuru abụghị eziokwu?"" BBC jụrụ ya ka o sị mata na ndị waporo ya bụ ndị Fulani, ọ zara na ya ma site na ụdị ha na ihe ha yi ụbọchị ahụ. Ọ sịkwa na n'ezie na ya anụghị asụsụ ha ịmata ndị ha bụ mana na-nkwado ha gosiri na ha bụ ndị Fulani. Ikechukwu sị na ndị ahụ si na ụgbo akpụ pụta kwawa ha mgbo agharaaghara n'ụgbọala ha ji nke mere mgbo ji kpọpuo ụgbọala ha tụta ya na ọkpa. Ọ sịkwa na mgbọ metutakwara onye nwaanyị nọ n'ụgbọala ha abụọ so. BBC kpọtụkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu bụ onye kwetere na n'ezie na awakporo ya bụ fada. O kwukwara na ndị ọrụ ha ka na-esi imi n'ala ịmata ndị mere ya bụ ihe. Amarizu sị na odobeghị anya ka ọ bụ ndị Fulani ka ọ bụ ndị ohi ọzo. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47783739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47783739,Rochas Okorocha: Victor Umeh erughi onye Rochas ga-atụpụrụ ọnụ - Onwuemeodo,Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha gwara BBC Igbo na ọga ya agaghị asa okwu Victor Umeh kwuru maka ya.,"Onwuemeodo kwuru sị na Rochas abụrụla ""akwaa akwụrụ"", na nke a mere na ha agaghị abịa ""gbuwe oge ha ịtụpụrụ Umeh ọnụ"". O kwuru na ịtụpụrụ Umeh ọnụ bụ ""ime ya ka ọ dị ka ọ bụ mmadụ ebe ọ na-abụghị"". Gịnị butere okwu a? Imo Elections: ""A dọrọ m Rochas aka na ntị maka APC, ọ jụ"" BBC Igbo gbara Victor Umeh bụ onye otu pati APGA ajụjụ maka ihe sere ya na Rochas mere o ji si n'otu ahụ pụọ. Umeh zara sị na enweghi ihe na-esere ha iche. O kwukwara etu o si dụọ Rochas ọdụ gbasara ọchịchị na ihe ga-eme mgbe ọ ga-aritu n'ọchịchị, mana Rochas ghaghapụrụ ha ma dinye ndị mmadụ ka ha kparịa ya. Umeh gakwara n'ihu kwuo na Rochas ji akụnaụba ndị Imo steeti na-elekọta ezinaụlọ ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43362079,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43362079,Agbapụtala ndị Naịjirịa 50 sị Libya aga Italy na mmiri,Ihe ruru mmadụ iri ise ka a gbapụtara na orimiri Mediterranean ụbọchị Satọde dịka ha na-achọ ibanye mba Itali dị Libya.,"Gọọmenti naịjirịa kpọlatara ọtụtụ ndị Naịjịrịa a na-ata ahụhụ na Libya n'ọnwa Jenuwarị Ndị nyere ha aka bụ ndị nchekwa nọ n'akụkụ mmiri na Libya, ndị ọrụ enyemaka na ndị dọkịnta na-akpagharị akpagharị a kpọrọ Doctors (MSF) without Boarders na aha bekee. Ndị Naịjirịa ahụ nọ n'elu ụgbọ mmiri gunyere ndị mbịmbịa mmadụ otu narị na iri ndị ọzọ oge a gbapụara ha. Ndị isi obodo ahụ kwuru n'ụgbọ ahụ ekpuchala na mmiri tupu ha erute ebe ha nọ. Dịka ndị MSF siri dee n'akara ha na twitter, ha kwuru na ebe obi kopụrụ ụfọdụ nime ha, onweghi onye meruru ahụ dịka ha gbapụtasịrị ha niile. End of Twitter post, 1 A ghara ndị Naịjirịọ́ sọ na ndị ahụ, ndị ọzọ si obodo ndị dị na mpaghara Afrịka ndị ọzọ. MSF ga-akpọ ha gaa ItalI dịka ha na-ekwu na ụgbọ mmiri ha ga-anọ na-agbapụta ndụ mmadụ ma nyere ha aka. Mana ndị ọrụ nchekwa Libya jidere, ha na-akpọghachi ha Libya maka na otu EU nyere ha ikike ịkwụsị ndị mbịambịa ibanye mba dị na Europe. Libya bụ isi obodo ndị mbịmbịa na-esi abanye Europe. Ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ anwụọla n'ụzọ nakwa n'elu mmiri Mediterranean dịka ha na-achọ ịga Europe. Gọọmeti Naịjirịa na gọọmenti ndị ọzọ dị n'Afịrịka ebidola mgbasaozi iji kpọlata ndị tọrọ atọ na mba Libya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48393253,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48393253,Ipob arrest: Anwụchiela 140 na Nsukka,"Onye okaikpe Nnamdi Kanu bụ Paul Achara ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ ndị uweojii jidere na Nsukka ụnyahụ abụghị ndị otu Ipob, kama ndị na-agara onwe ha.","Anwụchiri ndị Ipob 140 Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Achara kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka taa. E boro mmadụ otu narị na iri anọ a ebubu ịkpa nkata ha chọrọ iji chutuo Govementi Naịjirịa n'ike. Mmadụ 140 juru ebubo a si kwa na aka ha dị ocha. Otu onye ọkaikpe na-anọchite ha bụ Mazi Okeke kwuru na ebubo a erijughị afọ, kwuo kwa na mmadu 140 a na-aga akwa onye nwụrụ anwụ mgbe a nwuchiri ha. Okaikpe a gwakwara ndị ọkaikpe n'ekwuchitere ọnụ mmadu 140 a ka ha tinye akwụkwọ n'ụlọ ikpe ma kwụsịe ike na ya bụ ikpe. Ka ọ si dị, ndị a ga-anọ na mkpọrọ ndị uweojii ruo mgbe akpụpụru ha ụlọikpe. O kwukwara na ndị eji eji n'aha Ipob akarịala puku abụo (2000) na Naịjirịa. Ụlọikpe akwụsịla Lalong ịkwepụta ọche eze ọzọ na Plateau Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Dika ọ dizi ka omenala gọmenti imegharị oche eze na ọchịchị ọdịnala ndị obodo, ụlọikpe na Plateau steeti akwụsịla gọment steeti ahụ ịkpa aka n'oche eze ọdịnala ndị be ha. Ọkaikpe Christine Dabup kwuru na iwu a bụ maka iji kwụsị alo gọvanọ Simon Lalong ikewapụta oche ọdịnala abụọ ọzọ na steeti ahụ. Ndị uweojii wụchiri udele a Ndị uweojii n'Adamawa kwuru na ha emefuola ihe ruru puku naira iri atọ ịnye otu nnụnụ ha nwụchiri nri. Ha nwuchiri nnụnụ ahụ na onye nwe ya na Maiha dị na steeti ahụ. Ha kwuru na ha na-eme nyocha etu o si maputa na ebe ahụ bo ya ebubo na ya na ndị Boko Haram na-arụ kọ ọrụ Mana ngalaba na-ahụ maka nchekwa mbara na anụmanụ na-akpọ oku si tọghapụ nnụnụ ahụ. Theresa May akwaala arịrị maka Brexit Theresa May banyere n'ọkwa Praịm Minista n'afọ 2016 Anya mmiri dapụrụ Theresa May bụ Praim Minista mba Briten n'anya ka ọ na-ekwu maka nritu ya. May kwuru na ọ ga-arịtụ n'ọkwa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun. May pụtara n'igwe onyonyo na BBC ebe o nyere obere okwu na ọ ga-arịtu ma kwuo na otu ihe o ji ata ikikere eze bụ na o nwetanwughi Brexit. Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-akwụsịkwa ịbụ onye ndu otu ndọrọndọrọ a kpọrọ 'Conservatives' n'ala Britein. Arsene Wenger sị na ya ga-alọhachite azụ n'egwu bọọlụ N'egwuruegwu, onye bụbụ onyeisi ndị Arsenal bụ Arsene Wenger awụchiela ọzọ na ọba akụkọ ebe ọ na-ekwụ na ya bụ agaracha ""must come back"" n'egwu bọlụ. Wenger kwuru na n'ezie na ya chọbụrụ ezumike mana ugbua ụwa gbala ya gharị nke bụ na ọ gụwala ya ịlọhachị azụ n'egwu bọlụ. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị CAN agbarụọla ihu maka 'Fulani Radio' Ụmụ Naịjirịa agbarụọla ihu ebe ngalaba jịkọrọ ndị nkuzi Mahadum bụ ASUU nọ dịka ha gwara ndị mmadụ atana ha ụta ma ha gbaa abụbọ ọrụ ọzọ Biodun Ogunyemi bụ oneyisi ha gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ iji gwa oha niile na gọọmentị etiti emezubeghi nkwa ekwere ha. Onye mere ndị nkuzi Mahadum? Otu Christian association of Nigeria bụ CAN n'aha ịchafụ akatọọla atụmatụ gọọmentị Naịjirịa maka igwe mgbasa ozi nke ndị ọchịehi Fulani ha na-achọ ịgbape CAN hụrụ ya dị ka ngba okpuru gọọmenti Naịjirịa chọrọ iji mee ka Naịjirịa ghọrọ mba alakụba, mana ndi otu alakụba bụ ""jama'atu Nasril Islam"" kwuru na ọ bụ maka mgbasa ozi na ọmụmụ ndị ọchịehi Fulani. Iwu ọhụrụ amalitela na Taiwan Na mba ofesi mba Taiwan abụrụla mba mbụ n'ala Eshia ịnye iwu ga-eme ka nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị nweta ikike ịlụ onwe ha. Iwu ahụ a manyere ga-ebido ọrụ n'ụbọchị Fraide na be ha. Facebook abanyela egwu 'Cryptocurrency' Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị Facebook ekwuola na ha ga ewepụta ""Cryptocurrency"" nke ha a na-akpọ 'Globalcoin' na afọ 2020. Ha kwuru na nke a ga enyere mmadu niile aka ikwụ ugwọ ihe ọbụla n'igwe intaneti na agbanyehị ego obodo ha maọbụ ebe ha nọ. N'egwuregwu, Akpọọla Kelechi Iheanacho na Isaac Success esoro la na ndị ọgbaa bọọlu na premiership kachaa etufu oghere iji nye goolu. Nke a putara ihe mgbe agụkọrọ golu ha nyere na asọmpi premiership nke afọ gara aga." afirika-49545794,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49545794,"Arsenal vs Tottenham: Kama anụ Arsenal ga-agbalahụ ha, ekwobiri ya ọdụ",Egwu tara akpụ mgbe Arsenal an Tottenham Hotspur pịakọrịtara nkụ n'ọgbọegwu Emirate na mgbede Sọnde.,"Arsenal na Tottenham Arsenal malitere ịzọ onwe ha azọ mgbe Eriksen nke Tottenham tinyere goolu mbụ ha na nkeji 10 amalitechere ya bụ egwu. Ka a na-ekwu nke a, Kane were penariti tinyere Tottenham goolu nke abụọ ha nke mere ka ụwa gbaa Arsenal gharị n'oke ehihie. Obi kooro Arsenal n'elu ka Tottehman jidere ya bụ ọnọdụ ruo mgbe achọrọ ịpụ ezumike bụ mgbe ha jiri chiri ọkụ sowe Tottenham n'azụ. Mgbe ọfọrọ naanị otu nkeji ka oge ezumike kụrụ ọnụ ka Lacazette tinyere otu mpio ndị Tottenham iji mee ka ndị otu ha kuda ume. Mpempe akwụkwọ ịdọ aka na ntị nwụrụ ọnwụ na ya bụ asọmpị dịka Tottenham ritere ise, Arsenal rite anọ. Mgbe abatara ya bụ ezuike, Tottenham gbara mbọ ka ha were otu ọkpụ mara ya n'elu were laa mana ume ha ezughị ya dị ka Aubameyang tinyeere ha aja na garị site na-inye otu goolu na nkeji iri asaa na otu bụ nke mere na ike ha ha nhatanha. Ya bụ egwu bọọlụ biri na Arsenal 2 - 2 Tottenham Hotspur Akụkọ ga-amasị gị" afirika-52660269,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52660269,"Menstruation Disorder: PCOS, Adenomyosis, na ọrịa ndị ọzọ na-emetụta nsọ nwaanyị",Nwaanyị ọbụla ahụ zuru oke kwesịrị ị na-ahụ nsọ ya kwa ọnwa ọbụla.,"Oge nwaanyị anaghị ahụ nsọ ya bụ ma ọ dị ime maọbụ n'ihi nka. Mana o nwere ọrịa nwere ike ịkpata ka nwaanyị ahụ dị mma ghara ịhụ nsọ ya oge o kwesịrị. Ọrịa nwere ike ime ka nsọ nwaanyị ghara ịgba chaa chaa, maọbụ ịgbazu etu o kwesịrị, maọbụ gbakarịa etu o kwesịrị. Ọrịa nwekwara ike ime ka ahụ ụfụ karịa akarị oge nwaanyị na-ahụ nsọ ya. Lee ụfodụ ọrịa ndị ahụ: PCOS Ihe eserese na-egosi ọrịa PCOS Nke a bụ nke bekee kpọrọ 'Polcystic ovary syndrome'. Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ọrịa a kacha akpata atụghị ime ụnụnwaanyị n'ụwa. Ahụ nwaanyị nwere ọrịa a anaghị ewepụta akwanwa nke a kpọrọ 'ovary' oge o kwesịrị. Ọ bụ ya kpatara na ha anaghị ahụ nsọ ha oge o kwesịrị, maọbụ hụ ya ntakịrị. Oge ụfọdụ, nwaanyị nwere ọrịa a agaghị ahụ nsọ ya ihe karịrị ọnwa atọ, mana ọ dịghị ime. Ihe ndị ọzọ na-egosi na mmadụ nwere ike inwe ọrịa bụ: A chọpụtabeghi nke ọma ihe na-akpata ọrịa PCOS, mana nnyocha gosiri na ọ dịka ihe na-esi na nne efere na nwa. Endometriosis na Adenomyosis Ọrịa abụo a nwere ike ịkpata oke ahụ ụfụ ma nwaanyị na-ahụ nsọ ya. Dịka Dọkịta Chioma Ofoekii si kọwaa, akpanwa nwaanyị nwere ụfọdụ ihe ndị na-agba ya ogige, bekee kpọrọ 'inner lining'. Ihe ọbụla mere ka ihe ndị a gbara akpanwa ogige baa ebe ọzọ bụ ya na-akpata Endometriosis' N'aka nke ọzọ, mgbe ihe ndị a gbara akpanwa ogige banyere n'anụ ahụ (muscle) jigidere akpanwa, ya ka a na-akpọ 'Adenomyosis'. Ọrịa ụbụrụ Ụbọchị pụrụiche maka nsọ nwaanyị Dọkịta Ofoekii kwuru na o nwere ihe bekee kpọrọ 'glands' nke dị n'ime ụbụrụ mmadụ nke na-enyekwa aka maka mgbe nwaanyị kwesịrị ịhụ nsọ ya. Abụọ n'ime ha bụ nke a kpọrọ 'Hypothalamus' na 'Pituatary glands' bụ nke na-ewepụta 'hormone' dị iche iche. Ọ bụrụ na e nwee ọrịa ọbụla metụtara 'gland' ndị a n'ụbụrụ mmadụ, o nwere ike ịmetụtakwa nsọ nwaanyị. Ọrịa Ogbeke (Fibroid) Ọrịa ogbeke bụ ọrịa dị ka akpụ (cancer) mana ọbụghị ya, nke nwere ike ito n'ime afọ nwaanyị. Ya bụ ọrịa nwere ike ime ka ọbara gbakarịa nwaanyị n'oge nsọ ya. O nwekwara ike ịkpata ọbara ịgba nwaanyị n'oge ọnọghị na nsọ. Ọrịa Shuga Ụfọdụ nnyocha gosiri na nwaanyị anaghị ahụ nsọ ya dịka o kwesịrị nwere ike inwe ọrịa 'diabetes mellitus'. Nchọpụta gosiri na pasentị 25 ruo 50 nke ụmụnwaanyị na-arịa 'diabetes' na-enwe nhiahụ na nsọ ha. Hypothyrodism Eserese ebe 'Thyroid' dị n'ahụ mmadụ 'Thyroid' bụ obere akụkụ ahụ mmadụ a na-ahụ na mgbadata eko akpịrị (adam's apple). Ọ na-ewepụtakwa 'hormone' na-enye aka ịhazi nsọ nwaanyị. Ọ bụrụ na ọ karịa maọbụ ghara iru eru, ọ ga-eme ka nsọ nwaanyị gbaa nnukwu maọbụ gbaa ntakịrị. Nke a nwekwara ike imetụta etu nwaanyị si atụrụ ime. Ọrịa akpanwa Nke a bụ nke bekee kpọrọ 'uterine abnormalities'. O nwere ike bụrụ na akpanwa anọghị ebe o kwesịrị ịnọ, maọbụ na ọ haghị etu o kwesịrị ịha, maọbụ ihe ọbụla. Ọrịa ọbụla metụtara akpanwa nwaanyị nwekwara ike ịmetụta etu nsọ nwaanyị si agba. Ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị Ndị ọkachamara kwukwara na ọrịa ọbụla a na-ebute site na mmekọ nwoke na nwaanyị nwekwara ike ịmetụta etu nwaanyị si ahụ nsọ ya. Aha dị icheiche gbasara nsọ nwaanyị: Amenorrhea - Nsọ nwaanyị agbaghị agba Dysmenorrhoea - Nsọ ịfụ oke ụfụ Menorrhagia/Hypermenorrhea - Nsọ ịgbafe oke ma gbakarịa ụbọchị ole o kwesịrị Oligomenorrhea - Nsọ ịnọkari oge a tụrụ anya na ọ ga-abịa Hypomenorrhea - Nsọ ịgba nwantịntị" afirika-45775320,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45775320,Aisha Buhari ọ gbapụla egbe ọzọ?,Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari agbarụọla ihu na ihe na-eme n' otu APC dịka otu ahụ na-eme ntuliaka imeụlọ.,"A mara Aisha Buhari, nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye na-ekwu uche ya enweghị egwu ọbụla N'igwe okwu Twitter, Instagram na Facebook ya n'ụtụtụ taa bụ ụka, Aisha kwuru na ọ bụ ịhe tara ọjị anya ịgwa ndị mmadụ zụọ akwụkwọ ntuliaka oke ọnụ ahịa, ebe ha ma na ha chọrọ inye ndị nọkwa ikike ịnọchite ha ọzọ. Ọ sịrị na agbanyeghị na APC bụ pati na-akwado 'mgbanwe' ma nwee onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye dịka onyeisioche, na mpụ onye mere ka ọ dị ya (impunity) na-aga n'ihu n'otu ahụ. ""Ọ bụ ihe mgbawa obi na ndị chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị jị ego ha tara ahụhụ kpata zụọ akwụkwọ ngosi mmasị, ịchụ nta vootu, ebe ha ma na pati ha ga-enye ndị nọbu n'ọkwa ahụ ikike ịzọ ọzọ."" End of Twitter post, 1 Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Buharị bụ Garuba Shehu ịnụta ọsịsa ụlọọrụ onyeisiala n'okwu Aisha kwuru, ọzahị ekwenti ya, nke ọ na-asa ozi ekwenti(sms) e zigara ya. Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka ya na Twitter @OsasCruz na-ekwu na o nwere ike ọ bụrụ na o nwere ndị zubara n'akara Aisha Buhari tinye ozi ahụ. @Alvinvanx kwuru na o kwesịrị ka otu PDP jiri Aisha Buhari mee osote onyeisiala n'ihi eihe ọ na-ekwu. @O_Nife kwuru na etu Aisha Buhari sị agwa oke nọ n'ọhịa ihe dị na ngịga gosiri na alụmdịnanwunye ya na ndị ya amaghị kwụrụ, na ọ bụghị ihe ya chọrọ ịhụ na nwaanyị ya ga-alụ. Mana @mj_genius na-ekwu na ihe mere ka Aisha kwuo ụdị okwu a bụ n'ihi na nwanne ya nwoke zọrọ ọkwa gọvanọ Adamawa enwetaghị ihe ọ chọrọ na ọ bụghị maka ịhụnanaya ọ hụrụ ndị ọha Naijiria." 48100180,https://www.bbc.com/igbo/48100180,"School fees: Obodo eji ọkụkọ, ewu na atụrụ akwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ",Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'obodo Zimbabwe bụ Lazarus Dokora bụ onye mere ka maata nke a.,"Obodo Zimbabwe ehiwela iwu azụmahịa ha ọhụrụ nke gụnyere iji anụmanụ ndụ ịkwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ Ọ gwara ndị ntaakụkọ Sunday Mail Newspaper na ụlọakwụkwọ ga-anabata ndị na-enweghi ego ịkwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ ha n'oge. Ọ kwukwara na ọ bụghị naanị anụmanụ dị ndụ ka ha na-ana, mana ha na-anabata ndị nwere aka ọrụ. ""Ọ bụrụ na ha nwere ndị na-enye aka ịrụ ụlọ n'obodo, ha ga-enyere ha ohere i ji aka ọrụ ahụ wee rụpụta ụgwọ ụlọakwụkwọ ha,"" dịka ndị ntaakụkọ jiri kọwa. Ụfọdụ n'ime ụlọakwụkwọ ebidola ịnabata anụmanụ ndụ dịka ụgwọ ụlọakwụkwọ dịka Sunday Mail kwuru. Obodo Zimbabwe ehiwela iwu azụmahịa ha ọhụrụ nke gụnyere iji anụmanụ ndụ ịkwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ Onye na-arụ na ministri kọwatụrụ na okwu Dọkịta Dokora na ""Ndị nne na nna ya bụ ụmụ ụlọakwụkwọ nwereike ịkwụ ụgwọ site n'iji anụmanụ ndụ- Ya bụ maka ndị bi n'ime obodo, mana ndị nne na nna ndị ụmụakwụkwọ bị na mba nwereike iji aka ọrụ wee kwụọ ụgwọ ụlọakwụkwọ."" Iwu a sonyere aka ndị Zimbabwe kwere ka ndị mmadụ na-eji anụmanụ ndụ, dịka ewu, ehi, na atụrụ, ji wee kwụọ ụgwọ na mbite. N'ime iwu ndị ụlọ omeiwu ha wulitere n'izu a, a nabatara ka ndị mbite tinye aka n'ime akụnaụba ha nwere dị mfe gụnyere ụgbọala, igwe, dgz ji manye maka mbite dịka mpaghara ndị ntaakụkọ BBC World na-eleba anya na azụmaahịa kwuru. Dịka ụlọ ntaakụkọ Bulawayo24 siri kwuo, ego na-adịghị na mba Zimbabawe na-eme ka ndị mmadụ mefuo oge n'ụlọakụ. Gọọmentị siri na ọ bụ maka na ndị mmadụ na-ebupu ego na mba ndị ọzọ. Mana ụfọdụ ndị mmadụ ekwenyeghị n'okwu ha, ha kwuru na ọ bụ maka ọrụ na mwụlite adịghị n'obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45300480,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45300480,Lee nwoke kwuru na ọ na-aha mmiri n'ala Igbo,"""O nwere mgbe ụjọ tụrụ gị na mmiri nwekwara ike ghara izo dịka anyị nọ ebe a na-eche?"" ka BBC jụrụ ya.","""Aha m bụ Godwin Onasedu onye a ma dịka Ụmụnnanwaezuakụ nke mbụ n'Ifitedunu"" O weliri anya elu nwayọ nwayọ ka olu a na-anyị ya arụ, tụọ aka n'obi ya kwuo sị ""Mụ? Ka ị na-ala taa, mmiri ozuzo ga na-achụ gị ọsọ."" Ka anyị mechara si Ọka na-alaghachị Enugwu na mgbede ahụ, nnukwu mmiri malitere zowe. O zoro nnukwu mere na ọ fọrọ obere ka anyị kwụsị ụgbọala anyị n'ụzọ. O zogidere ruo mgbe anyị garuru Enugwu. Ịchọta onye na-aha mmiri Onasedu nwere ụlọarụsị abụọ; otu nke dị n'ụlọ ya na ọzọ dị n'obere ọhịa dị n'akụkụ ụlọ ya Ọ bụghị taa ka akụkọ bidoro ịgagharị na e nwere ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-aha mmiri. Ndị mmadụ na-ekwu na ndị a na-aha mmiri na-akpa ike ọfụma, ma na-eme ka mmiri zoo maọbụ ghara izo. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na enweghị onye nwere ikike iji ihuigwe mee ihe masịrị ya ọkachasị ime ka mmiri zoo; na ọ bụ aghụghọ. Ndị ụlọọrụ 'Nigerian Metrological Agency' bụ ndị ọkachamara gbasara ụdịrị ihe a na Naịjirịa kwuru sị na enweghị onye nwere ike ime ụdịrị ihe a. O ji kandụlụ ọcha nakwa nke edo edo oge ọ na-akpọku mmiri Ọtụtụ ndị na-aha mmiri juru na Naịjirịa. Ha na-eji ịha mmiri n'emume dịka akwamozu, ụbọchị ncheta ọmụmụ nakwa ndị ọzọ akpa ego. Ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ndị mmadụ na-akpọku ndị na-aha mmiri ka ha jiri mmiri mebie emume onye iro ha na-eme. O were BBC ọnwa anọ ịchọta Godwin Onasedu bụ onye na-aha mmiri n'obodo Ifitedunu dị n'okpuruọchịchị Dunukọfịa n'Anambara steeti, kwere ka anyị maa ya aka ịma ma ọ bụ eziokwu na ọ ga-emenwu ka mmiri zoo. Onasedu kwuru na e ji ịha mmiri mara ezinaụlọ ya kemgbe ọgụ afọ. Ihe e ji aha mmiri Iji mee ka mmiri gbadata, o kwuru ka anyị weta ihe ndị dịka: Ụbọchị akara aka O kwuru sị na o gosiri ndị mmadụ ike ya na 1972 ka o jidere mmiri n'otu ọdọ ụgbọelu Anyị zutere ya n'ihu ụlọ ya ka ọ na-akpọ ahịhịa ọkụ, sị na ọ na-achụ mmiri ozuzo, n'ụbọchị Ọgọst 17, 2018. O kwuru sị ""e nwere ndị na-eme akwamozu nyere m ọrụ ka m jidere ha mmiri, mana ebe ọ bụ na ị chọrọ ịnwa ike m, aga m ewedata obere mmiri ozuzo na-agaghị ezote aka."" Anyị nyere ya ihe ndị ọ sị anyị weta maka ịchụ mmiri, ọ gwara onye na-enyere ya aka ka ọ wụnyụọ ọkụ aha ka a gaa mezuo nke fọrọ afọ n'ụlọarụsị. Site n'ihe o kwuru, ọkụ ọ na-amụ na-achụpụ mmiri ozuzo ahụ; ọkụ ahụ kwụsị ire, mmiri ga-ebido izo. Ọtụtụ ndị obodo gbakọrọ ịhụ ihe ọ chọrọ ime N'agbanyeghị na ọ bụ oge udummiri ka a nọ, anwụ nọ na-acha ụbọchị ahụ, mana oge anyị nyochara ihe Google nwere ikwu maka mmiri izo ụbọchị ahụ, o kwuru na mmiri ga-emecha zoo ụbọchị ahụ. Ndị obodo nụrụ maka ihe chọrọ ime gbakọrọ sowe anyị; nne, ndị nne, ndị nna ma ụmụaka so anyị n'azụ ka Onasedu yi uwe ọcha n'ahụ nakwa n'isi du anyị na-aga. Ụlọarụsị ya bụ osisi abụọ toro ezigbote ogologo ekere ụdọ nakwa akwa na-acha edo edo nakwa ọbara ọbara. Karama kaịkaị dịbu n'ime ya nakwa ihe ndị ọzọ anyị amaghị tọgbọcha n'ala ebe ahụ. Mmiri ebidoghị izo ozugbo Ọ malitere ịkụ ogene ya nakwa ịkpọku mmiri ihe ruru nkeji 45 mana mmiri ezoghị, ndị mmadụ malitere ịlaghachị ụlọ ha ka ọ kwụsịrị. Ọtụtụ ihe mere n'ime awa abụọ anyị nyere ya ịha mmiri, dịka otu onye isi na-adịchaghị mma gara n'ụlọ bido ọkụ ahụ a wụnyụrụ, nke onye na-enyere Onasedu aka kwuru kpatara mmiri ezoghị. Mmiri bidoro izo obere obere, gbanwee ihu igwe. O zoro naanị nkeji ise tupu ọ kwụsị. Mmiri ahụ ezosịghị ike, mana ọ bụ ụdịrị nke na-eme ka ala dịrị mmiri mmiri. Ndị mmadụ ga-ekweta ihe ha ga-ekweta, mana ihe anyị ma bụ na mmiri zoro n'ezie." afirika-53042313,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53042313,Imo State Politics: Ihe Uche Nwosu kwuru maka ebubo ohi na ọchịchọ Biafra,Uche Nwosu bụ onye ji ọkọlọtọ Action Alliance zọọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti ekwuola na ọ dịmma ka e were nwayọ na-achọ nwereonwe ndị Igbo.,"O kwuru na iji ekworo na ọgụ agaghị e mee ka ndị Igbo nweta Biafra. Nwosu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere si na ihe kacha mkpa ugbua bụ i bi n'udo ka ụmụnne. Mgbe ndị nso nso BBC news Igbo jụrụ ya maka ego ndị Imo ya na nna ya ukwu Rochas Okorocha buru gbalaga, o kwuru na ọ bụghị eziokwu kama na ọ bụ kepu kepu ndị mmadụ na-ebugharị. O kwuru na ihe Okorocha ji ego Imo rụpụta bụ ihe eji anya ahụ. Mgbe ha jụrụ ya maka ala ọ nara ụfọdụ ndị mmadụ n'Imo, o kwuru ka atụọrọ ya aka otu ala ọ nara ndị mmadụ mgbe ọ nọ n'ọchịchị Okorocha. Nwosu ọ ga-azọ oche ọchịchị n'afọ 2023? Ọ zara si na o nweghị ebumnobi ugbua gbasara ọchịchị n'ọdịnihu makana ọ maghị ihe echi ga-amụta. N'okwu ya, ""ihe ka mụ mkpa ugbua bụ inye ndị na-achị ugbua nkwado ma ịzọ ndụ m maka coronavirus makana ọ bụ onye dị ndụ na-ekwu okwu ọchịchị"". Uche Nwosu ekwuputala ndụmọdụ o nyere Hope Uzodinma maka ọchịchị I burukwanụ gọvanọ Imo steeti echi? Nwosu kwuru na ọ ga-akpa ndị Imo obi anụrị site n'ime ka tụmadị ndị ntorobia nwe ezigbo ọrụ aka nakwa ime ka ndị mmadụ gụọ akwụkwọ n'efu. Ebubo inye ndị Fulani ala n'Imo steeti? O kwuru na ọ na-anụ ka ndị mmadụ na-ekwu na ndị Fulani na-abata n'ala Imo mana ọ chọrọ ka ndị Imo jiri nwayọ na-ebugharị akụkọ ụgha maka inye ndị Fulani ala. Nwosu kwuru ka ndị mmadụ chetakwa na ndị Igbo bi n'ugwu awụsa na-egoro ala n'aka ndị ugwu na-arụ ụlọ ebe ahụ. O kwuru na ndị Fulani anaghị azụ ala kama ha chiri anụmana ha richa nri otu ebe, ha kpọrọ ha laghachi ebe ha si bia. Gịnị mere Rochas arụghị ụzọ dị mma? O kwuru na Okorocha rụrụ ụzọ dị mma mana ụfọdụ oge a rụcha ụzọ o mebie, arụgharịa ya. Ndị nso nso bokwara ya ebubo na ya na nna ya ukwu etinyeghị akụrụngwa n'ụlọgwụ ha rụgasiri. O kwuru na ụfọdụ ụlọọgwụ Okorocha rụrụ abụghị iwu na ọ bụ ọchịchị ya ka a ga-etinye akụrụngwa n'ime ya kama ebe ọ kwụsịrị gọvanọ ọzọ bataranụ agawa n'ihu. Ebubo akwụghị ụgwọ ezumike nka Nwosu kwuru na mgbe Rochas Okorocha batara ọchịchị n'afọ 2011, na ọ kwụrụ ụgwọ ezumike nka eji ndị ọrụ ruo afọ iri na ise. O kwuru na mpu socha we mee ka ụfọdụ ndị eji ụgwọ ghara inweta ego ha. N'okwu ya, ya mere na ndị a na-ewetabeghị ego ha ga na-etisi mkpu ike ka a ga-asị na o nweghị onye a kwụrụ ụgwọ n'ọchịchị nke Rochas Okorocha. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-47442262,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47442262,Women representation in governance: Anambara state ji ụmụnwaanyị aga mba,"Kemgbe akụkọ pụtara na Anambara steeti enweela ọkaikpe ukwu nwaanyị nke mbụ ha, okwu a kpụ n'ọnụ bụ steeti nke kachasị akwado ụmụnwaanyị ịpụta ihe n'ọchịchị obodo nakwa ọkwa dị mkpa n'ala Naijiria?","Ụmụnwaanyị enwere ọnụ okwu n'okwu ọchịchị obodo? N'afọ 2000, Naijiria wepụtara atụmatụ ịmapụta oke dị pasent 35 n'ọchịchị obodo maka ụmụnwaanyị nke a kpọrọ 'Affirmative Action' na bekee iji mejupụta nkwupụta ọgbakọ ụmụnwaanyị na Benjing n'afọ 1995. Ndị Anambara na-ekwu sị na ọ bụ ha bụ ọkaibe n'Alaigbo n'okwu ụmụnwaanyị inwe ohere ịchake n'okwu ọchịchị obodo. End of Twitter post, 1 Ihe ha kwuru ọ bụ eziokwu? Lee ihe nchọpụta BBC Igbo mere gosiri: Lee ka steeti dị iche iche si ahụta ụmụnwaanyị site n'ọnụọgụgụ ohere ịnọ n'ọkwa dị elu ha nyere ụmụnwaanyị: Anambara steeti 1. Ndị imeobi ọchịchị Gọọmenti dịka ọ dị na mgbaso iwu: Iri na otu(11) n'ime 47 2. Ụlọomeiwu nke steeti: Ise(5) n'ime 30 3. Ụlọ nnọchiteanya: otu (1) n'ime 11 4. Sineti: Otu nwaanyị 5. Okaikpe: Isii(6) n'ime 30 Imo steeti Na nkọwa Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Patrick Nze, ndị Imo na-akwado ụmụnwaanyị n'ụzọ pụrụiche. nke na ha nwere ụmụnwaanyị ole n'ọkwa: 1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: 10 n'ime kọmịshọna 27 2. Ụlọomeiwu nke steeti: 5 n'ime 27 dị na steeti ahụ. 3. Ụlọ nnọchiteanya: O nweghị 4. Sineti: O nweghị 5. Ọkpaikpe: Abia steeti 1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: 5 2. Ụlọomeiwu nke steeti: Atọ (3) n'ime mmadụ 13 3. Ụlọ nnọchiteanya: Otu (1) 4. Sineti: Onweghi Ebonyi steeti Odeakwụkwọ mgbasaozi Ebonyi bụ Emmanuel Uzọr kwuru na gọọmenti Ebonyi nwere nnukwu ịhụnanya n'ebe ndị iyom nọ nke na ha nwere ụmụnwaanyị. Mana ọ bụghị ka akụ ilu na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ. E wezuga dịka o kwuru na ndị isioche okpuru ọchịchị atọ na osote onyeisioche okpuru ọchịchị dị 13 dị na steeti ahụ. 'Gọọmenti Ebọnyị hụrụ ụmụnwaanyị n'anya nke ukwu' Leekwa ka ọnọdụ ụmụnwaanyị siri kwụrụ n'ebe ndị ọzọ na steeti ahụ: 1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: Anọ (4) 2. Ụlọomeiwu nke steeti: Atọ (3) 3. Ụlọ nnọchiteanya: Onweghi 4. Sineti: Onweghi 5. Ọkpaikpe: Asaa (7) Enugwu steeti Ụmụnwaanyị enwere ọnụ okwu n'okwu ọchịchị obodo? 1. Ndị imeobi gọọmentị nke steeti: Atọ (3) 2. Ụlọomeiwu nke steeti: 3. Ụlọnnọchiteanya: Otu(10) n'ime asaa(7) 4. Sineti: Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-54420264,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54420264,Charles Duruji bịara ileta m nihi ejighi m ahụ mana egburu ya n'ụlọ m,"Okebata Sunday bụ nwanna Charles Duruji, onye nwụrụ n'ogbe ndị uweojii dị na New Heaven n'Enugwu, ekwuola na ha chọrọ ikpe nkwụmọtọ gbasara ọnwụ nwanne ha.","Etu esi gbu Charles Duruji n'ogbe ndị uweojii Okebata kwuru na Duruji bụ Inginia gara ịhụ onye uweojii nwaanyị ọ na-akwado ịlụ n'Enugwu mgbe o jekwudoro ọnwụ ya. Ka ndị be Charles Duruji si nwete ozi ọnwụ ya Okebata si na a kpọrọ ha n'ekwenti n'elekere iri na abụọ nke ime abali nke Sepụtemba 28, si ha biawa na nwanne ha anaghị ekute ume . N'oge na-adịghị anya, onye ahụ kpọghachiri si ha biawasiwi ike. N'elekere ise nke ụtụtụ, a kpọkwara ha si na nwaanne ha anwụọla. Nke a mere, ka ha chọrọ ya gawa Enugu, ebe a kpọ ha gaa n'ụlọ ozu ka ha hụ ozu Duruji. O kwuru na mgbe ha hụrụ ozu ya, egbukasiri ya mma n'ahụ ya. Kedụ ka Charles Duruji si nwụ? Charles na nwunye ya ASP Chidimma Victoria Nwala bụ nwaanyị onye uweojii nke Duruji na-akwado ịlụ gwara BBC na ọ bụ maka na ahụ adịghị ya kpatara Duruji ji hapụ Imo steeti ebe o bi bịawa Enugwu. N'abalị ahụ ọ bịara, a malitere ịnụ ụda egbe n'ogbe ndị uweojii nke gosiri na ọgbaaghara dị n'ezi. Duruji gwara nwunye ya ahụ ka ọ lakpuo n'ụlọ mposi ga zoo ma mechie ọnụ ya. O teghị aka, ọ nụrụ ka ndị mmadụ gbakara ụzọ ha ma bata n'ime ụlọ. Ọ nụkwara ka di ya tiri mkpu sị ""abụghịkwa m onye uweojii, abụkwa m onye nkịtị"", mana ndị ahụ sị ya mechie ọnụ. Nke a bụ ihe ikpeazụ ọ nụrụ tupu e gbuo di ya. Chidimma ka nọ n'ụlọọgwụ oge o gwara BBC okwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50809106,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50809106,Ekwulobia Royal Stool: Ọtụtụ ndị obodo Agba gbara igwe ha alụkwaghị m,Ndị mmadụ na-achọ imata nke bụ eziokwu n'esemokwu dị n'etiti ndị obodo Agba dị n'Ekwulobia na Igwe ndị Ekwulobia bụ Igwe Emmanuel Onyeneke.,"Akụkọ pụtabụrụnụ na-ekwu na ndị Obodo Agba kwuru na ha na Igwe ha agaghị enwe mmekọ ọbụla. Nke a mere ka BBC gbaa onye chibụru dịka onyeisioche 'Agba Development Union"" nke ngalaba Legos ma chikwaa dịka onyeisioche ngalaba ehiwere maka udo na Ekwulobia bụ Chibueze Ezegwu ajụjụ maka ihe na-eme. Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ Ezegwu kwuru sị "" Kamgbe Igwe banyere n'oche Eze, nsogbu dị, mgbe ọbụla a sị ka-eme ụdo, ịgwe na-ajụ"", N'afọ 2016 ka ndị ofufe dị iche iche biara ikpe udo mgbe Igwe na ndị otu ya kpọrọ ha ka ha kpee udo. O kwukwara na mgbe ndị ofufe a mechara nyocha ha, ha gosiri ya ndị Ekwulobia nke Igwe kwenyere. Kama mgbe ọ lara ọ megharịrị ma jụ nchopụta ndị otu udo a mere. Nke mere ka ndị obodo Agba nwee nzụkọ ma mee ntụliaka imara ma ha a ga akwụsị i ga be Igwe. Ọnwụ Igwe: Ihe kpatara ya Mmadụ narị abụọ na otu kwetere na ha agaghi enwezị ndi nnọchite anya n'obi Igwe ebe mmadụ abụọ kwenyere na ha ga-enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe. Mgbe ha kpebiri nke a , ha degara Igwe na ndị Ekwulobia niile akwụkwọ ma gwa ha ebe ndị Agba kwụ. Ezegwu kwuru sị "" Anyi degara Igwe na ndị Ekwulobia akwụkwo gwa ha na ndị Agba agaghị enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe ruo mgbe ọ bụla igwe chọrọ udo"" Mbo niile BBC gbara inweta Igwe Emmanuel n'ekwentị amụtaghi mkpụrụ. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-55556727,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55556727,Glaucoma: Ọrịa ọjọọ nwere ike ime ka anya pịa mmadụ n'otu ntabi anya,Ị ma na i nwere ike bilie n'ụra otu ụbọchị chọpụta na ị nakwaghị ahụ ụzọ?,"Ama m na ị ga-asị 'tụfiakwa', maọbụ 'Chineke ekwela', mana ọrịa Glaucoma maọbụ Cataract nwere ike ime ka ihe dị otu a mee. Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ Ọbụrụ na anya mmadụ adịghị, ọchịchịrị ga-agbachi ahụ mmadụ niile, ụwa enwekwaghị ihe ọ ga na-atọ. Ya mere o ji dị mkpa ichekwa anya gị ma gbochie ọrịa Glaucoma nakwa Cataract, nke nnyocha gosiri na ọ bụ ha kacha ebutere ndị mmadụ ikpu isi n'ụwa niile. Gịnị bụ Glaucoma? Glaucoma na-emekarị ndị gbagoterela n'afọ, mana ụmụaka nwekwara ike inwe ya E nwere akwara si n'anya mmadụ gaa n'ụbụrụ isi; Bekee na-akpọ ya 'optic nerve'. Ọ bụrụ na ike gwụ akwara a, ọ gaghịkwa enwe ike iziga ozi iji mee ka ụbụrụ ghọta ihe mmadụ na-ahụ. Glaucoma bụ ọrịa na-emebi akwara 'optic nerve' ma mee ka mmadụ kpuo isi n'otu ntabi anya. Dọkịta anya aha ya bụ Ugochukwu Eze kọwara na ọ bụghị na ọrịa glaucoma na-abịa n'otu ntabi anya, kama ọ na-eji nwayọ nwayọ amalite, nke pụtara na mmadụ agaghị enwe ike ịchọpụta ruo mgbe ọ kawanyere njọ. Dọkịta Ugochukwu Eze bụ dibia anya n'ụlọọgwụ 'National Eye Centre' dị na Kaduna Mana oge ahụ, ọ dịla njọ, onwekwaghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime maka ya. Dọkịta Eze kwuru sị: ""Ọ bụrụ na a chọpụta glaucoma n'oge, anyị nwere ike inyere onye ahụ aka ka anya ya ghara ịkpọ kpam kpam."" ""Mana ọ bụrụ na ya bụ ọrịa apịala mmadụ anya, onweghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka."" Ihe gbara ọkpụrụkpụ i kwesịrị ịma maka Glaucoma: Felipe Gomes bụ onye na-eme egwuregwu 'paralympics' na mba Brazil. Ọ bụ Glaucoma na Cataracts nke o butere site n'afọ nne ya mere ka o kpuo isi. Mgbochi glaucoma Ime nnyocha anya kwa mgbe kwa mgbe ga-enye aka ịchọpụta ọrịa glaucoma n'oge ma malite inweta ọgwụgwọ Gịnị bụ Cataracts? Cataract bụ ọrịa kachasị ebute ikpu isi na Naịjirịa Cataract bụ ọrịa na-eme ka ihe dịka urukpu (cloud) kochie mkpụrụ anya mmadụ. Nnyocha gosiri na ọ bụ cataract kacha akpata mmadụ ikpu isi na Naịjirịa. Mana ndị ọkachamara na-eji ịwa anya (eye surgery) agwọta ọrịa cataract. Ọrịa a na-eji nwayọ amalite, ọgaghịkwa enye onye ahụ nsogbu ruo mgbe ọ kawanyere njọ. Ihe e ji amakarị ọrịa Cataract bụ mmadụ inwe nhịahụ ịgụpụta ihe edere n'akwụkwọ maọbụ ịhụ ụzọ nke ọma n'abalị. Mmadụ ịhụ ihe dịka ọ gbara abụọ bụkwa njirimara ya Ihe nwere ike ibute Cataract bụ: Ime nnyocha anya kwa mgbe kwa mgbe ga-enye aka ịchọpụta ọrịa Cataract n'oge. Mgbochi Cataract: Ọgwụgwọ Cataract:" afirika-51900915,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51900915,MRKH Syndrome: Ụbọchị m chọpụtara na m enweghị ọtụ mgbe a mụrụ m,Ị nụtụla na nwaanyị nwere ike o nweghi ọtụ na akpa nwa si n'afọ nne ya pụta ụwa?,"Lee Julian Peter, onye Kenya, onye ndị dọkịta kwuru na o nweghị oghere ọtụ, maọbụ akpanwa nwaanyị. O nwekwaghị ụzọakpa nwa Bekee gboro ""Cervix"", ma nwekwaa naanị otu akịrị (kidney). Julian nwere ọrịa Bekee kpọrọ Mayer-Rokitansky-Küster-Hauser syndrome (MRKH). Ọnọdụ a pụtara na o enweghị ọtụ na akpanwa. Mgbe ụfọdụ ndị a mụrụ n'ọnọdụ a nwere ike ịnwe otu akịrị. Nwaanyị ọbụla nwere ọrịa MRKH agaghị ahụ nsọ ya. Julian kwuru sị: ""E nweghị m akpanwa, nke mere na m ahụtụbeghi nsọ m. ""Otu a ka m hụrụ onwe m, ọnweghị ihe ọ pụtaara m. ""Ụfọdụ na-echere m ụdị echiche dị iche iche. ""Ihe ọ sọro uwa ha kwuwe"" Ihe osise iji gosipụta nwaanyị nọ na nsọ Julian chọpụtara ọnọdụ ya oge ọ dị afọ iri na asaa. Mana ọbụ ka ọ gachara afọ iri na abụọ ọ mechere nchọpụta a ka ọnụ kwere ya kọọrọ onye ọrụ BBC bụ Anne Ngugi ọnọdụ ya. O kwuru sị: ""A chọpụtara m ihe a mgbe m dị afọ iri na asaa dịka nwata akwụkwọ. ""A gara m ụlọọgwụ mgbe ahụ adịghị m, ọkpa m zara aza. ""Ihe mbụ dọkịnta juru m bụ, kedu mgbe ịkpeazụ m hụru nsọ m? ""Enwenụbeghị m ụdị ihe ahụ."" Mgbe Julian kọọrọ ndị mmadụ ọnọdụ ya, ha nyere ya ndụmọdụ dị icheiche. ""Ọnwere onye nke gwara m chọọ ụlọekpere ebe a ga-ekpere m ekwere. ""Onye nke ọzọ sị n'aka nne m ochie dị na ya maka na-eji ịta amusu mara ndị be anyị bụ ndị Ukambani. ""Ha nwere ike ukwu ihe masịri ha, achọghị m ịma. ""Ihe ka m mkpa bụ ka m sị ahụta ya. ""M gewe ha ntị, onyewe m nsogbu, mgbe ahụ ọ dịwa m ka eziokwu adị n'ihe ha na-ekwu."" Nnyocha ndị dọkịta chọpụtara na ụzọ akpanwa Julian si na mpụta mechie. Ha mechara waa ya ahụ iji mepe akpanwa ya, mana ọnweghị isi. ""Ebere m akwa arịrị abali atọ mechaa mechiere onwe m ọnụ. ""Mụ na nne m, bụ naanị onye m nwere, nọ n'ụlọọgwụ mgbe ahụ. ""Ya bụ ihe riri ya ọnụ. ""A ma m na ọ jụru onwe ya ajụjụ dị omimi maka ya bụ ihe, ịmata ka ọnwere ebe o sị mejọọ."" 'A chọghị m ịwa ahụ' Julian gụrụ Bayọlọgi n'ụlọakwụkwọ mahadum. Nke a nyere ya nghọta etu ahụ ya si dị. Ọ gwara ndị dọkịta na ya achọghị ịwa ahụ n'oge ahụ n'ihi na ọ chọrọ ịlaghachị ụlọakwụkwọ je gụchaa akwụkwọ ya. Mana ka afọ iri gachara, Julian laghachiri azụ n'ụlọọgwụ ga waa ahụ. O kwuru sị: ""A wara oghere ọtụ m awa. ""Onweghị ka ya bụ ihe siri metuta ndụ m maka na MRKH anaghị emetuta ka i si ebi ndụ gị."" Mana ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa a na-anọkarị n'oke echiche. Ọtụtụ n'ime ha na-aga anata ntuziaka n'aka ndị Dọkinta Saịkọlọgị iji nabata ọnọdụ ahụ. Mana ndụmọdụ Julian na-enye bụ na ""ọ bụrụ na ị ghọta ọnọdụ ahụ gị, ịchefụgodu ịmụ nwa."" ""E seela m foto imeahụ ugboro anọ mana ọnweghị ehe (ovary) a hụrụ, nke bụ na ọnweghị ka a ga-esi wete akwa n'ime ahụ iji mee m IVF. ""Ọ ka mma ịnabata ka Chi gị si kee gị. ""Mana ịchọpụta na gị na ibe gị abụghị otu adịghị mfe. ""Ọ dị mkpa ịchọta otu onye ị ga-akọsara ụwa gị.""" 48794567,https://www.bbc.com/igbo/48794567,Police Recruitment: Ọnụọgụgụ ndị Ọwụwa Anyanwụ kacha dị nta na ndị a ga-ewe n'ọrụ,Ngalaba gọọmentị Naijiria na-ahụ maka nhazi na nlekọta ndị uweojii nke a kpọrọ 'Police Service Commission' eweputala aha ndị ahọpụtara ga-aga nnyocha ikpeazu maka iwe ha n'ọrụ uweojii n'afọ 2019.,"Ndí uweojii Naijiria Dika ngalaba ahụ depụtara na webụsaitị ha ụbọchị Tọọzdee, mmadụ dị 210,150 bụ ndị ga-esonye na nnyocha ahụ. Mana n'ime ndị a, naanị mmadụ dị 5,566 ka e siri na steeti Abịa, Anambara, Ebọnyi, Enugwu na Imo steeti bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ (South East) wee họrọ. Nke a bụ ọnụọgụgụ kacha nta na mpaghara isii e nwere na Naijiri nke gụnyere 'North Central', 'North-West', 'North-East', 'South-South' nakwa South-West. Ndị a họọrọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijiria kacha dị nta Iji maa atụ, ndị a họọrọ nanị na steeti Kaduna di mmadụ 12,297. Nke a karịrị mmadụ niile a họọrọ na steeti ise nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria. Ndị a họrọ nanị na mpaghara North West karịrị ọnụọgụgụ mmadụ nile a họrọ na mpaghara South West, South South nakwa South East. Gini kpatara nke a? Ụmụnwanyị ndi Uweojii Naijiria Emeka Monye bụ onye ihe gbasara ọrụ nchekwa doro anya gwara BBC Igbo na ọ bụghị iwu na ndị niile aha ha pụtara ugbua bụ ndị a ga-ewe n'ọrụ. Monye kọwakwara na steeti niile nwere ọnụọgụgụ mmadụ ole a ga-esi ebe ahụ were. Ọ gakwara n'ihu kọwaa na o nwere ike bụrụ maka na ọnụọgụgụ ndị si mpaghara Ugwu tinyere akwụkwọ ka e wee ha n'ọrụ karịrị nke ndị ndịda. O kwuru sị, ""ebe ọ bụ ndị ga-anọ n'ọkwa 'constable' ka a na-ewe ugbua, ọtụtụ ndị si ndịda Naijiria agaghị achọ itinye akwụkwọ n'ihi na ụgwọ a na-akwụ ndị 'constable' dị nta"". Monye kwukwara na onwekwara bụrụ mmegide ka gọọmenti na-emegide ndi bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ, mana a ga-amata nke ọma ma e wepụta aha ikpeazụ ndị a ga-ewe n'ọrụ. Ndị uweojii Naijiria Mana Goddy Uwazuruike, onye ọkaiwu bụrụkwa onye bụbu onyeisi Aka Ikenga, kwuru na ọ bụ mmegide ka gọọmentị etiti na-emegide ndi ọwụwa anyanwụ Naijiria. Uwazuruike kwuru na ""mmegbu gọọmentị etiti Naijiria na-emegbu Ndigbo buru ibu mana ọ gaghị eme ka obi jụọ Ndigbo oyi."" Nyocha ikpeazu nke a ga-eji họpụtazie ndị a ga-ewe n'ọrụ uweojii nke afọ 2019 ga-amalite n' abalị mbụ nke ọnwa Julai,2019. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-49937033,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49937033,Omoyele Sowore: Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ nwa amadi a,Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore.,"Omoyele Sowore Onye nyere iwu a bụ Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2019. Ọkaikpe Ojukwu nyekwara iwu ka a tọhapụ Olawale Bakare bụ onye e ji ya na Sowore. Mana ụlọikpe ahụ kwuru na Sowore ga-akwụ otu narị nde naịra ebe Bakare ga-akwụ nde naịra iri ise tupu ha enwere onwe ha. Ọkaikpe Ojukwu dọkwara mmadụ abụọ ahụ aka na ntị ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla n'ọdịnihu. Ojukwu kwukwara na Sowore na Bakare ga-anọgiderịrị n'ime obodo Abuja. Cheta na otu ụlọikpe enyebuola iwu ka a tọhapụ Sowore, mana ndị DSS kachiri ntị ka jide ya. Sowore zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụawarị afọ a. Ọbụkwa ya bụ onye nhazị ngagharịiwe a kpọrọ 'RevolutionNow'. Ọbụ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ 'Department of State Service' (DSS) jichiri Sowore na Bakare kamgbe onwa Ọgọst. Ndi DSS boro ha ebubo na ha na-achọ ịkwatu ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. E bokwara Sowore ebubo iji ụzọ nzuzo bupu ego dị puku kwuru puku dọla. Mana Sowore na Bakare sị na aka ha dị ọcha n'ebubo ndị ahụ e boro ha. Akụkọ na-abịa." afirika-52357164,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52357164,Abba Kyari: Onye ọ ga-anọchị anya ya?,"Ndị ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị sị n'ebe uche ndị mmadụ dịzi ugbua bụ onye ga-anọchi anya Abba Kyari, bụ onyeisi ndị ọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari.","N'ime mmadụ anọ a onye Kyari so n'otu ndị ọnụ kachasị eru n'okwu n'ọchịchị Onyeisiala Buhari ya mere ọtụtụ na-eche na onye ọbụla ga-anọchi ya ga-eritekwa ụdị ikike o nwere. Otu onye ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị si Mahadum Abụja bụ Abubakar Karị sị na Buhari nwere ọtụtụ ndị enyi o che nwereike ịnọchi Kyari. ""Eche m na Buhari nwereike ịhọrọ otu n'ime Babagana Kingibe, onyeisi ndị 'Custom' bụ Hameed Ali maọbụ mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu dịka onyeisi ọrụ ọhụrụ ya,"" Kari kwuru. ""Ọ gaghị abụ ihe itụnanya ma Buhari họrọ otu n'ime ndị a."" Kari sị na ọ ga-ara ahụ ị sị na gọvanọ Kaduna Steetị bu Nasir el-Rufai ga-abụ onye e nwereike ịhọrọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ si na-eche. Onyeisiala Buhari and Abba Kyari bụ enyi karịa afọ iri anọ Ọ sị na ọkwa onyeisi ọrụ nke Onyeisiala dị ezigbo mkpa mana ị gaghị eji ya tụnyere ọkwa gọvanọ. ""Ụfọdụ na-eche na Onyeisiala Buhari ga-ahọrọ onye bụbu mịnịsta ihe na-eme n'obodo bụ AbdurRahman Dambazau mana echeghi m na ọ ga-eme ya maka na Buhari ahọrọghị ya n'ọchịchị ya nke abụọ."" Mgbe anyị kpọtụụrụ onye na-ahụ maka ọdịmma pati APC na Naịjirịa bụ Ibrahim Masari, ọ sị na ọ ka-abụ ụtụtụ ikwu okwu banyere nke a. ""Ebe ọ bụ na ọkwa a abụghị nke a na-emere ntuliaka, ọ ga-adị mma ka a hapụ Onyeisiala Buhari ka o ruchaa uju ọnwụ Kyari tupu o kwupụta onye ga-ewere ọkwa ahụ."" Masari kwuru. Babagana Kingibe Onyeisiala Muhammadu Buhari na Babagana Kingiggbe Kamgbe Buhari weere ọchịchị nke ugboro abụọ n'afọ 2019, Kingibe abụrụla ezi enyi nye ọchịchị a nke ka nke bụ maka na ọ bụ onye Borno Steeti dịka Abba Kyari. Na-agbanyeghi na onye bụbu Onyeisiala bụ Umaru Yar'Adua chụpụrụ ya n'ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị etiti, nke a nwereike imegide ohere o nwere. Tinyekwara ọgbaghaara dapụtara mgbe a kagburu ntuliaka nyere MKO Abiola mmeri n'afọ 1993, Kingibe bụ osote Abiola mana ọchịagha Sani Abacha mechara mee ya mịnịsta ihe na-eme n'obodo. N'ihi ihe ndị a, ụfọdụ ndị si mpaghaara ọdịda anyanwụ nwereike ha agaghị a nabatacha ya. Mana Kingibe maara ihe egwu na-akụ n'ihe banyere ọrụ ọha na eze. Hameed Ali Onyeisi ndị ụlọọrụ customs Ọ bụ onyeisi ndị ọrụ 'Custom' na Naịjirịa. Ali na Onyeisiala Buhari malitere ịrụkọ ọrụ kamgbe ụbọchị ha n'ọrụ ndịagha. Ọtụtụ na-ahụta ya dịka otu n'ime ndị Buhari tụkwasịrị obi. Ndị enyi Ali na-agba ama etu o si bụrụ onye na-akwụwa aka ya ọtọ, nakwa onye na-eme ihe n'usoro. Ọ bụrụ na e mechaa họrọ ya, nke a nwereike ọ gaghị adị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị makana onweghi onye ọ na-ele anya n'ihu. Adamu Adamu Ọ bụ ya jị ọkwa mịnịsta agụmaakwụkwọ kamgbe afọ ise Buhari weere ọchịchị n'afọ 2015. Ya na Buhari arụkọọla ọrụ ọtụtụ afọ ma bụrụkwa otu n'ime ndị nwereike ịgakwunwu onyeisi ya n'otu ihu n'ime ọbi ọchịchị Onyeisiala. Tupu e nye ya ọkwa mịnịsta, Adamu bụ onye odeakwụkwọ. Ọ na-ekwupụtakarị uche ya n'ihe na-eme n'obodo nakwa na mba ndị ọzọ. Ọ bụrụ na Adamu mechaa nọchie anya Abba Kyarị ọ ga-abụ ihe ime ụlọ ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga-asị na enweghi oke mgbanwe. Gọvanọ Nasir el-Rufai Malam Nasir El-Rufai gọvanọ Kaduna steeti Gọvanọ Nasir el-Rufai nke Kaduna Steeti bu coronavirus ugbua - Ya bụ otu ọrịa ahụ gburu Abba Kyarị. Akụkọ kwuru na gọvanọ a nyere aka azụ iji nwete ọkwa a n'afọ gara aga, mana e nweghi ihe akaebe gosiri nke a. Kamgbe Buhari hiwere otu CPC ka el-Rufai malitere ịbụ ezi enyi ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye nwere ọnụ na gọọmentị Naịjirịa. Ọ bụrụ na a họrọ ya dịka ụfọdụ ndị na-ekwu, ọ ga-abụ ohere nye ya n'ịkwalite ebumnobi ya ịbụ onyeisiala na 2023 ma ọ bụrụ Buharị chizuo ọchịchị ya. Ndị ọzọ a na-atụanya nwerike ịnọchi Kyari bụ:" afirika-54825122,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54825122,Vitamin D na uru ọbara n'ime ka ọkpụkpụ sie ike n'ahụ mmadụ,Ahụ mmadụ nwere akụrụngwa dị iche iche na-enyere ya aka ịrụ ọrụ nke ọma ma gbochie ụfọdụ ọrịa dị aṅaa.,"Akụrụngwa ndị a gụnyere ọtụtụ vitamin nke vitamin D so n'otu n'ime ha. Gịnị bụ Vitamin D? Vitamin D bụ akụrụngwa ndị ahụ mmadụ chọrọ n'ebe ọ dị obere iji rụọ ọrụ ọfụma ma kwalite ndụ. Vitamin D dịka aha ya si dị abụchaghị Vitamin kama ọ bụ akụrụngwa na-enye aka n'imepụta 'homonu dị n'ahụ mmadụ. Kedụ ebe e si enwete vitamin D? Onye dọkịta na-ahụ maka nyocha bụ Chris Ohakpolamugwo sị ndị mmadụ na-eche na ọ bụ anwụ n'enye vitamin D n'ahụ na nke bụ asị Ọ sị na ""eziokwu bụ na anwụ anaghị enye vitamin D kama na anwụ na-enye aka ịmịpụta ya n'ahụ mmadụ. O kwuru na ụzọ kachasị mma iji mịpụta vitamin D n'ahụ mmadụ bụ site n'ịnwa anwụ nke ọma ọkachasị anwụ ụtụtụ. Ebe ọzọ e si enwete bụ site n'iri ụfọ nri ndị pụrụiche ọkachasị ndị na-enye 'calcuim' gụnyere; Uru vitamin D baara n'ahụ mmadụ Vitamin D na-arụ ọrụ buru ibu n'ahụ mmadụ nke gụnyere ime ka ọkpụkpụ na eze gbasie ike, ichekwa ahụ megide nje ịbata na ihe ndị ọzọ. Ọkpụkpụ na eze gbasie ike Vitamin D na-achịkwa 'calcium' na phosporus dị n'ọbara nke na-enyeaka ka ọkpụkpụ ahụ gbasie ike. Ibuso ọrịa agha Eserese nje coronavirus Nyocha ndị ahụike mere bụ nke e nyochagharịrị n'afọ 2018 gosiri na vitamin D na-enyeka ibuso ọrịa dịka influenza agha. Nyocha ọzọ e mere na nso nso a gosikwara na ọtụtụ ndị na-ebute ọrịa coronavirus kachasị na ndị vitamin D kọrọ n'ahụ. Nke a pụtara na otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, vitamin D na-enyeaka ibu agha megide ọrịa coronavirus nakwa ọrịa iku ume ndị ọzọ. Nyocha ka na-aga n'ihu ịmata kpọmkwem etu vitamin na-eji ebuso coronavirus agha, mana ndị ọrụ ahụike enyela ndụmọdụ ka a na-aṅụ akụrụnbwa vitamin D ọkachasị n'oge oyi. Vitamin D na-enyekwa aka iwulite ahụike ụmụaka a mụrụ ọhụrụ site n'ime ka ha too ọfụma ma gbasie ike dịka ngalaba ahụike ụmụaka nke mahadum John Hopkins si depụta ya. Ime ka nwaanyị dị ime gbasie ike: Ozi si n'aka otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) sị na ọ dị mma ka nwaanyị dị ime inwe vitamin zuruoke n'ahụ ya. Ha sị na ọ na-enye aka ịmụ nwa buru ebu ma gbasie ike, ma gbochiekwa ịmụ nwa na-akaghị aka mgbe oge ya erubeghi. Mana ha dọrọ aka na ntị ka a kpachapụ anya etu e si aṅụ ọgwụ ndị na-enye vitamin D maka ọghọm dị na ya. Ihe enweghi vitamin D n'ahụ nwereike ibute Nyocha gosiri na ọtụtụ ndị bu coronavirus kachasị na ndị na-enweghi vitamin zuru oke Ọ bụ eziokwu na ahụ mmadụ na-amịpụta vitamin D mana mgbe ụfọdụ ọ naghị ezu oke. Ihe nwereike ịkpata ezughi oke a gụnyere ụdị anụ ahụ mmadụ nwere, mmadụ ịnọkaarị n'ebe anwụ na-adịghị acha, mpaghara ụwa mmadụ bi nakwa etu e si chee nwata ara. E nweghi vitamin D n'ahụ nwereike ibute; Igbo tụrụ ilu sị na 'imebiga ihe oke adịghị mma', n'otu aka hụ ndị ọrụ ahụike sị na ọ bụ eziokwu na vitamin D dị mma n'ahụ mana ọ dịghị ka karịa n'ahụ mmadụ. Ọ bụrụ na ọ karịa, o nwereike ibute ọkpụkpụ, akwara, nakwa ihe ndị isi ike nke ga-egbochi ọbara agazughi n'ahụ ka o kwesịrị." afirika-50231873,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50231873,Buhari vs Atiku: Ihe ndi Igbo nwere agba na-ekwu maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị,Otu ndị na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị na okwu gbasara onye meriri na ntuliaka onyeisiala 2019 agbaghị ha gharịị n'ịhị na ọ bụ eze ama na a ga-echi.,"N'ụbọchị Wenezde, Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa bụ 'Supreme Court' weliri onyeisiala Muhammadu buhari aka elu dịka onye meriri ntuliaka maka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a. Mana ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Peace Chukwudi gwara BBC Igbo na ihe mere bụ mmezu afa nke otu Ipob gbara na o nweghi uru dị n'isonye na ntuliaka 2019. ""Ọ bụ mmezu ihe Ipob kwuru na ọ baghị uru isonye na ntuliaka nke ekpebirila onye ga-emeri tupu a tụọ vootu."" O kwukwara na mkpebi ahụ bụ amamikpe nye ndị si na ha ga echekwa vootu a tụụrụ ha ka mmiri ghara ịba ya ntị. ""Nke a bụ ngosi ihe bụ iberibe bụ ịma eziokwu, ịhụ eziokwu mana kwenye n'asị."" Buhari emeriela Atiku na 'Supreme Court' Onyeisiala Muhammadu Buhari Abubakar Atiku na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ 'Peoples Democratic Party' (PDP) gbara Buharị na ndị pati ya bụ 'All progressives Congress' (APC) akwụkwọ. Ha kwuru na Buharị na ndị APC mere nnukwu nrụrụaka na ntuliaka ahụ. Onyeisi ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ Tanko Muhammed na ndị ọkaikpe isii ọzọ so kpee ya bụ ikpe. Ha gụnyere: Bode Rhodes-Vivour, Kayode Ariwoola, Amiru Sanusi, John Inyang Okoro, Ejembi Eko and Uwani Abba-Ajji. Ha niile kwekọrịtara na ebubo nrụrụaka Atiku boro Buharị enweghi isi na ọdụ. Nkwa Buhari na Atiku: Ihe Ndigbo chere Ụlọikpe mkpesa bụ 'Court of Appeal' ekwubuola na ọbụ Buhari meriri na ntuliaka ahụ dịka ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) si kwupụta. Mana Atiku na ndị PDP ekwetaghị nke mere ka ha buru ikpe ahụ pụ 'Supreme Court' nke bụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa. Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka mkpebi ụlọikpe Ọ bụghị naanị otu Ipob otu,a ndị ọzọ nwere agba n'Igbo etinyela ọnụ na ya bụ mkpebi Ụlọikpe Kachasị. Lee ihe ha kwuru: Nke a ga-enye ohere maka onye Igbo ịbụ onyeisiala na 2023 - Otu South-East for President 2023 N'uche ya, onye nchịkọta otu South East for President 2023 bụ Rev Okechukwu Obioha kwuru na ""Ihe ọ pụtara na Buhari ga-ano ruo afọ ato na-abia tupu ndị Ọwụwanyanwụ bụ ndị ọ ruru ""Mkpebi a bụ etu Chineke si kwuo. Buhari ga-achizi afọ asatọ, ọ(ọchịchị) gbadatazie na ndida Naijiria. PDP na APC kwesiri inye ọwụwaanyanwụ ọkwa onye ha zọrọ ha onyeisiala."" Otu ahụ gara n'ihu rio Atikyu ka ọ nọgide na otu PDP ma kwado ha iwere onye Igbo dịka onye ga-azọrọ pati haọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Ụlọikpe Kachasị dara ya - ọkaiwu Goddy Uwazuruike Goddy Uwazurike bu onye ọkaiwu ma burukwa onye bụ bụ aka Ikenga Obi adịghị Goddy Uwazuruike bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye bụbụ onyeisi Aka Ikenga mma maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị n'okwu Atiku na Buhari. Uwazuruike siri na, ""A gbasoghị ikpemkwụmọtọ na ya bụ ikpe."" ""Ụlọikpe Kachasị dara ya site na ịhapụ ilebanye anya n'ihe niile gbara ọkpụụ bụ isi okwu n'ikpe."" ""Anya onye ọbụla dị na ya bụ ikpe tupu egwu adagharia n'ikpe mgbegharị. Mkpebi a bụ ịwụ ụkwụ n'ala."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Youth Relationship: Ụmụagbọghọ ekwuola ihe ha ga-emere ọyị ha nwoke" afirika-47422197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47422197,APC Suspension: Ume Oshiohmole ezughi ịwepụ m n'APC - Osita Okechukwu,Kepukepu anụrụ na izu gara aga bụ na-anapụla Osita Okechukwu bụ onyeisi ụlọọrụ Voice of Nigeria (VoN) ọrụ ya.,"Osita Okechukwu DG VoN Na mkparịta ụka ya na BBC, Okechukwu is na ya ka bụ onyeisi ya bụ ụlọọrụ ka ọ dị ugbua. O mere ka anyị mata na nke bụ eziokwu bụ na ya na onyeisi ndị Pati ha bụ APC bụ Adams Oshiohmole nwere nghọtaghị. Mgbe anyị jụru ya ka o so na ndị akpachapụrụ na pati APC, ọ zara na nke ahụ abụghị eziokwu. Gee Okechukwu ntị ebe a Osita Okechukwu sị na ya ka bụ Onyeisi ụlọọrụ VoN Na ya ka kwụ chịm na APC maka na Oshiohmole ezughi ị wepụ ya na ya bụ pati ya so were hibe. O kwuru na ya bụ okwu bụ egwuruegwu na ihi na pati nwere usoro eji ewepụ mmadụ. Okwukwara sị na obi dị ya ụtọ ka ndị Igbo siri tuo vootu na ntuliaka onyeisiala nke gara aga maka nke a ka nke gara aga mma. Akụkọ ga-amasị gị APC Imo steeti chọrọ ịkwatu Oshiomhole EFCC anwụchiela onyeisi nhazi ego Atiku Oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga-eji dozie ala Igbo - Charly Boy" afirika-52298357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52298357,Coronavirus tips: Etu ị ga-esi chekwa ụmụ gị ịmerụ ahụ n'oge nnọrọ n'ụlọ a,Ọrịa Coronavirus bụ ebelebe na-egbu n'ọtụtụ mba ụwa niile ugbua.,"N'ihi oke ogbugbu si n'ọrịa a pụta, gọọmentị mba dị icheiche gbachiri ụlọakwụkwọ, ụloụka nakwa ọgbakọ ọha mmadụ iji kwụsị mfesa ya. Nke a pụtara na ezinaụlọ ọbụla na-anọkọtazi ọnụ ụgbua ka ọ bụ oge ezumike. Mana ị ma etu ị ga-esi chekwa ụmụ gị n'ụdịrị oge a? Anyị na Rejoice Olori na-ahụ maka ahụike ụbụrụ ụmụaka nwere mkparịtaụka. Ọ kọwara na n'oge a, ndụ ụmụaka dịka ndụ gị agbanweela n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ, nakwa na ọ dị oke mkpa na ndị nne na nna tinyere nke a n'uche ha. O kwuru na ọ ga-enyere ha aka ị ma ụdịrị agwa ha na-akpaso ụmụaka. Lee ndụmọdụ ndị o nyere maka nke a 1.Mee ụmụ gị enyi n'oge a O kwuru na ihe mbụ ndị nne na nna na ndị na-elekota ụmụaka ga-eme bụ ị bịa ha nso ""Ọ bụrụ na ụmụ gị nwee nkwenye n'ebe ị nọ, ọ ga-adịrị ha mfe ị gwa gị uche ha ma ha nwee nsogbu ọbụla"" ka o kwuru. O kọwakwara na nke a ga-enye aka ka ụmụaka gee gị ntị mgbe ị gwara ha okwu. 2.Chọtara ha ihe ha ga na-eme Ụmụaka nwere ndụ nke ha nakwa ihe ndị ha na-eme tupu ọnọdụ agbanwee Ị nọ n'ụlọ n'enweghi ihe aka na-eme nwereike ịme ka ha dịba aghara(disorderly) O kwuru na ị chọtara ha ihe ha ga-eme dịka ị ga ozi n'ụlọ ga-enye aka gbochi nke a. Ị nwekwarị ịtinye ọtụtụ egwuregwu ezinaụlọ ga na-emekọta ọnụ. 3.Hie asaa n'anya Oge a abụghị oge ụmụaka ji apụ igwuri egwu O kwukwara na oge a bụ oge ụfọdụ ụmụaka ọ kachasị ndị na-abanye ntorobia ga-eji na-agbanwe N'ọnụ ya ""hie asaa n'anya, ị ga-achọpụta ọtụtụ ihe ma ị mee nke a"" Ya bụ tinye anya na ndị enyi ha, ekwentị ha nakwa ụdịrị agwa ha na-egosi mgbe o nweghi onye nọ nso 4.Chọpụta ihe ndị na-atụ ha egwu Nke a gbasara ahụike ụbụrụ ụmụ gị, Rejoice kwuru na oge a ga-esi ike maka ụmụaka na-enwe nsogbu ụbụrụ. Ọ sị gịnwa nne na nna nakwa ndị na-elekọta ụmụaka bịa ha nso ma na-akpalitekwa mmụọ ha maka ihe ọbula nwereike ị na-atụ ha ụjọ. 5.Kọwara ha maka ọrịa Coronavirus Ụfọdụ ndị nwere ụmụaka pere mpe nwereike ha agaghị aghọta ihe butere mgbanwe na ndụ ha. ""Biko gbanụ mbọ kuziere ụmụ gị maka Coronavirus nakwa etu o si efesa"" O kwukwara ka a gba mbọ hụ na ụmụaka na-akwọ aka ha ma nọrọ n'ụlọ n'apụghị n'ilo egwu egwu. ""Ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na ndị enyi ha nọkọọ, ha kpọọ ha n'ekwentị onyonyo"" ka o kwuru. Rejoice Olori, ọkacha mara maka ahụike ụbụrụ ụmụaka. 6.Jie onwe gị ma ị na-agwa ha okwu. Rejoice kọwara na ụmụaka bụ obere ndị okenye, O kwukwara na ha na-eṅomi agwa ha hụrụ ndị mmadụ na-akpa. ""A gaghị m atụ asị, o siri ike ị bụ nne maọbụ nna ọ kachasị n'izu a mana jiri ndidi na-eso ụmụaka, abanara ha mba"" O kwuru ka ọ ga-akwụsị ha ịtụ gị egwu maọbụ ịnọmi agwa ojọọ. Na ngwụcha ọ kọwara na ụmụaka niile, n'agbanyeghị afọ ole ha dị ka jiri ihunanya amụta ihe karịa ụjọ. Ihe ọbụla ị na-eme, jiri ịhụnanya na ndidi na-eso ụmụ gị n'ihi na oge a siri mmadụ niile ike, ọ kachasị hanwa." afirika-48721529,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48721529,Ghana arrests Nigerian professor : Ihe onyonyo etinyela ọkammụta Prof Austin Nwagbara na nsogbu?,Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi ekwuola na ihe onye ọkammụta Naijiria bụ Austin Nwagbara kwuru maka agụmakwụkwọ Ghana abụghị ikwuwa ọnụ kama ọ bụ okwu dịka ọkachamara.,"Austin Nwagbara bụ onyenkuzi na mahadum, University of Lagos gara ezumike nkuzi 'Sabbatical' na mahadum, University of Ghana Inwe ịfụnanya nye ala nna ya tinyere Ọkammụta Austin Nwagbara bụ onyenkuzi na mahadum nke Lagos, gara nkuzi ezumike (Sabbatical) na mahadum nke Gana na nsogbu n'ihi okwu a na-ebo ya na o kwuru. Nwagbara danyere na mmiri ọkụ n'aka mahadum Gana ebe ọ gara ọrụ nkuszi otu afọ (sabatical) ka ihe onyonyo pụtara ebe ọ na-agwa ọgbakọ ndị e chere bụ ndị Naijiria okwu, na-ekwu na agụmakwụkwọ Naijiria ka nke Gana mma. N'ihe onyonyo ahụ nke na-efegharị na soshal midia, Nwagbara kwuru na ndị Naijiria ka nwee ndị ka mara ihe a na-ekwu na agụmakwụkwọ karịa ndị ogbo ha ndị Gana dịka o kwukwara n'mahadum nke Naijiria nwere ebu nwee mfụ karia ha. Okwu ahụ mere ka mahadum Gana gbakụta ya azụ ma mee ka ndị uweojii mba ahụ nwuchie ya, ma mechaa tọhapụ ya. Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi Mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naijiria bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'okwu Nwagbara kwuru nke na ndị Ghana ga-akpaso ya ụdị agwa ha kpasoro ya. ""Anyị echeghị na ọkammụta ahụ kwuru ihe karịrị ọnụ ya dịka onye ọkacha mara. ""Obi adịghị anyị mma etu ndị ike dị na aka na mba Ghana si soo ya bụ okwu. ""Ebe ọbụla ndị ọkammụta anyị gara n'Afrịka, o kwesịrị ka a kwanyere ha ugwu dịrị ha. ""Ndị ọkammụta Naijiria kwesịkwara ịkwanyere ogbo ha ndị mba ọzọ ugwu."" Cheta na otu ASUU nke University of Lagos dọpụrụ mba Ghana aka na ntị sị na ha achọghị ịnụ na mmiri bara ntị Ọkammụta Nwagbara. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43442729,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43442729,Onyeisiala mba Mauritius Gurib-Fakim ga-arịtu - onye ọkaiwu,Naanị nwaanyị onyeisiala mba Afịrịka nwere bụ onyeisiala mba Mauritius Ameenah Gurib-Fakim edela akwụkwọ arụkwaghị m dịka ọ ga-akwụsị ọrụ ụbọchị Fraidee abalị iri abụọ na atọ ọnwa a bụ Maachị.,"Ameenah Gurib-Fakim bụrụ nwaanyị mbụ ahọpụtara dịka onyeisiala n'afọ 2015 Gurib-Fakim nọ na nsogbu gbasara etu osiri mefuo ego. Ọ gọnarịrị ime ihe ọjọ ọbụla dịka a na-atụ ya aka na o mefuru ego n'onwe ya site n'ụlọakụ ndị a na-enyere aka. Mana taa, naanị ụbọchị ole na ole ka o kwuchara na ya agaghị arịtụ, onye ọkaiwu ya bụ Yusuf Mohamed gwara ndị ntaakụkọ na ọ ga-arịtụ. Onyeisiala ahụ ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a. O kwuburu na ya ga-arịtụ ụbọchị Mọnde 12 Maachị mana oge ọ na-arịtughi, ụjọ tụwara ndị mmadụ na e nwere ike inwe tiguo zọgbuo na mba ahụ. Otu akwụkwọ mgbasaozi L'Express buru akụkọ n'ọwa Feburuwarị na onyeisiala ahụ jiri kaadị ndị Planet Earth Institute nyere ya wee zụọ akwa na ọla ndị ọzọ. Akwụkwọ ahụ kwuru na e nyere ya kaadị ahụ maka na ọ bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ iji kwụọ ụgwọ ọtụ ọrụ enyemaka ha rụrụ n'aha onyeisiala ahụ. Mana Gurib-Fakim kwuru na ya nwere ụdị kaadị ahụ sitere n'ọtụ ụlọakụ ahụ. O kwuru na eweghachiela ihe ruru puku dola iri abụọ na asaa n'ụlọakụ ndị ụlọọrụ ahụ dịka ndị ụlọọrụ PEI gwara BBC. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49883188,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49883188,Nigerian Independence: Onye Igbo ka ndị Briten nyefere akwụkwọ ikike nnwereonwe n'aka.,Ndị a so na ndị gbara mbọ nwereonwe Naịjirịa mgbe mba Briten ji ọchịchị Naịjirịa.,"Ha tara ahụhụ dị iche iche ịhụ na Naijirịa kwụụrụ onwe ya dịka mba zuru ezu n'ọgba mbaụwa. Nke a bụ akụkọ ha n'otu otu. Nnamdi Azikiwe Nnamdi Azikiwe 1904 - 1996 Nnamdị Azikiwe, onye a na-etu Zik nke Afrika bụ nwa afọ Igbo a mụrụ na Zungeru Ugwu Awụsa nke bụ Naịja steeti taa n'afọ 1904. Nna ya bụ onye Ọnịcha bụ ebe o toro. Zik tokwara na Legọs bụ ebe ọ nọ mụta asụsụ Yoruba. Nke a mere na Zik na-asụ asụsụ Hausa, Igbo na Yoruba nke ọma. Ọ gara akwụkwọ na Mahadum ndị a Howard University, Lincoln University nakwa University of Pennsylvania. Zik mechara bụrụ Gọvanọ Genaralụ nke Naịjirịa n'afọ 1960 ruo afọ 1963 tupu ọ bụru onyeisiala n'afọ 1963 ruo 1966. A na-ahụta Zik ka isi ahụrụ kwawa okpu n'ihe gbarasara nwereonwe Naịjirịa. Zik rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ mgbe ọ gụchara akwụkwọ. Mmasị ya bụ ịchịkọta Afrịka niile ka ha bụrụ otu. Ọ bụ ya bụ onyeisi pati ndọrọndọrọ bụ National Council of Nigeria and Cameroon (NCNC) Nke a mere e ji akpọ ya Zik nke Afrịka. Ahmadu Bello Ahmadu Bello 1910 - 1966 Ahmadu Bello bụ onye ndọrondọrọ ọchịchị a mụrụ na Sokoto steeti n'afọ 1910. Ọ bụ ya bụ Premịa mbụ na nke ikpeazụ n'ụgwu awụsa. Ọ bụkwa Ahmadụ Bello bụ Sarduana nke Sokoto - ya bụ echịchị dịka Ọkpara Eze . O so bụrụ isi ahụrụ kwawa okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjriịa nakwa Ugwu Awụsa mgbe ahụ. Ọ bụ ya bụ onyeisi ndị pati Northern People's Congress (NPC). Agbụrụ ya bụ agbụrụ Uthman dan Fodio. Bello gara Sekọndrị skul na Sokoto Provincial School nakwa Kastina Training Collage Ọ mechere bụrụ onye nkuzi na Sokoto Middle School. Ọ gakwara ala Bekee ga gụọ Local Government Administration n'afọ 1948. Abubakar Tafawa Balewa Abubakar Tafawa Balewa 1912 - 1966 Ọ bụ Abubakar Tafawa Balewa ka Ahmadu Bello họpụtara ka ọ nọchite anya ya dịka Praịm Minista mbụ nke Naịjirịa. Amụrụ ya na Bauchi steeti bụ ebe ọ gara akwụkwọ nke koran mgbe ndị Briten bidoro kwuwe okwu ịgụ akwụkwọ nke ha n'Ugwu Awụsa. Ọ mechakwara kuzie na Bauchi Middle School ebe ọ mechere bụrụ onyeisi ndị nkuzi. N'afọ 1944, a họpụtara ya dịka onye ga-eso ga ọzụzụ n'obodo oyibo bụ ebe ọ gụru akwụkwọ n'University of London. Mgbe ọ lọtara ya bụ ọzụzụ ka o jiri rụọ ọrụ dịka onye nlekọta ụlọakwụkwọ n'Ugwu Awusa bụ ebe ọ sị banye ndọrọndọrọ ọchịchị. A họpụtara ya dịka onye nnọchite anya n'Ụlọ Omeiwu n'afọ 1947. Ọ jụru na ọ gaghị akwado nnwereonwe Naịjirịa maka na ọkwenyere na ndị Ndịda ka ndị Ugwu nwee ndị ma ihe. Ọ bụ ya na Ahamdu Bello bụ Sardauna nke Sokoto bụ ndị hibere Nigerian People's Congress bụ pati ha ji mee ndọrọndọrọ ọchịchị na 1951 bụ ebe ọ nọ dọ ndọrọndọrọ dịka osote onyeisiala. Barewa gbara mbọ ka Naịjirịa dịrị n'otu site na ikpokota pati atọ dịka NPC, National Council of Nigeria and Cameroons na Action group ka ha bụru otu were ndọrọndọro. Ọ mechara nọrọkwa ka Pramịa mgbe emere nwereonwe na 1960. Obafemi Awolowo Obafemi Awolowo 1909 - 1987 Obafemi Jeremiah Oyeniyi Awolowo bụ otu n'ime ndị bụ isi ahụrụ kwawa okpu na dị natụtara Briten ọchịchị na 1960. Ọ bụkwa onye ntaakụkọ bụrukwa onye nkuzi, ọkaiwu dịka ọ gụchara akwụkwọ n'ala Bekee. Ọ kwa ya bụ Pramịa mbụ nke ndị ọdịda anyanwụ mechaa bụrụ Minista okwuego dị n'aka na Naịjirịa. Awolowo bụ onye mbụ akpopụtara aha dịka onye ndu ndị Yoruba. O kwusiri ike na ọ bụ site na ndị agbụru ọbụla ịkwụrụ onwe ha n'ime Naịjirịa ka oke ga-esi baara ọha. Dịka onye ndụ ndị pati ha bụ Action Group, ọ n'isi okwu gbasara nnwere onwe Naịjirịa. A na-ahụta Awolow dịka onye ma ihe nwere akọ na uche miriemi. Jaja Wachukwu Ọ bụ Alexandra nke Kent, onye nọchite anya Queen Elizabeth II bụ onye gụpụtara ozi Queen n'ụbọchị ahụ bụkwara onye nyere Jaja Wachukwu akwụkwọ ikike nnwereonwe nke Naịjirịa n'aka Jaja Nwachukwu (1918 - 1996) bụ nwa afọ Igbo sị ala Ngwa bụ otu n'ime ndị rụrụ ọrụ pụrụiche mgbe Briten nyere Naijirịa Ọchịchị. Ọ bụ ya bụ onyeisi ụlọomeiwu mbụ nke Naịjirịa mgbe ahụ. Ọ Wachukwu ya ka onye nnọchite anya Queen Elizabeth nke Briten na njem ajụ bụ nwaada Alexandra nke Kent nyere akwụkwọ ikike nnwereonwe akpọrọ Freedom Charter na Bekee na 1 kotoba 1960. Mgbe nke a mechere, ọ mere njem na mba Amerịka bụ ebe enyere ya nturuugo pụrụiche nke akpọrọ Blue seal nke Philadelphia, Pennsylvania nakwa ọtụrụ nke steeti Atlanta, Georgia. Jaja gụrụ akwụkwọ akwụkwọ na Goverment School Afikpo na Yaba Higher College nakwa Gold Coast People's College dị na mba Ghana. Ọ gụkwara akwụkwọ na University of Dublin bụ ebe ọ gụrụ akwụkwọ dịka ọkaikpe na 1943. Wachukwu sọ chụọ nta nnwereonwe Naịjirịa n'aka Briten. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48090157,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48090157,Nigerian Kidnapping: Anwụchiela 'eze mmụọ' ndị ntọrị na mpaghara ugwu,"Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu kwuru site na mbọ ha na-agba ikpochapụ ohi na mpụ na Naịjirịa, ndị ọrụ ya anwụchiela papa ukwu ndị ntọrị.","Salisu Abubakar, bụ onye ndị uweojii sị na ọ bụ 'eze mmụọ' ndị ntọrị na ndị omekaome na mpaghara ukwu dabara n'aka ndi uweojii ka ha mechara nyocha site na ogige ha kpọrọ ""Operation Puff Adder"" na Bekee. Ndị ọrụ nyocha uweojii kwukwara na ha nwụchịkọrọ mmadụ 18 ọzọ bụ ndị ntọrị na ndị oji egbe ezu ohi na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa (Kaduna, Katsina, Niger na Kogi), dịka akwụkwọ ọnụ na-ekwuru uweojii bụ Frank Mba zipuru ụbọchị 28 nke Epreelu. Ndi uweojii sị na ha natara egbe AK-47 dị 22, egbe ọka ise na ọtụtụ mgbọ egbe. Ndi uweojii nwere mkpebi na ọ bu ndị ha ji na-akpa ụfọdụ n'ime ike a na-akpa na Kaduna steeti nakwa ebe ndị ọzọ dị nso na ya, dịka igbu otu eze akpọrọ Agom Adara n'ukpuru ọchịchị Kajuru n'ọnwa Ọktoba 2018. Ha sị na agbanyeghi na ndị a aka ha ji nọ na otu dị iche iche, ọ bụ ""eze mmụọ ha bụ Salisu Abubakar jikọtara ha dum. Ọ bụ ndị uweojii si IRT, TIU na mpaghara ndị ọzọ so mee nyocha a mịtara mkpụrụ. Gịni bụ ""Operation Puff Adder"" Ọ bu n'ọnwa Epreelu nke 2019 ka onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu na ndị agha nakwa ndị DSS hibere atụmatụ a. Atụmatụ a bụ ihe ha chọrọ iji memina ndị omekaome na ndị ntọrị na-enye Naịjirịa nsogbu, ọkachasị na mpaghara ugwu ahụ. Ọ bu na Oshogbo, isi obodo Osun steeti, ka emere emume malite atụmatụ a." 43651609,https://www.bbc.com/igbo/43651609,Iba Lasa abanyelaa ihe ruru steeti 20 na Naịjiria,Ịba Lasa na-aga njem ugbua egbuola mmadụ 142 n'obodo 20 n'ala Naịjiria ebe echere n'ihe ruru mmadụ 400 bu ọrịa ahụ n'ime ahụ ha.,"Ngalaba na-ahụ maka ọrịa dị icheiche ekwuola na Meningitis ebidola ife ndị mmadụ Ngalaba na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa dị icheiche a kpọrọ NCDC n'aha ịchafụ bụ ndị na-ewepụta ọnụọgụgụ a nke mere n'izuụka bidoro Maachị 26. O gosi kwara na ndịọrụ abụọ na-ahụ maka ahụisike n'ụlọọgwụ dị icheiche, otu n'Abia eferela n'ọnwụ site n'ọrịa iba Lasa a. Obodo Edo, Ondo, Bauchi, Plateau, Anambra, Ebonyi, Nassarawa, Kogi, Lagos, Osun na Abia so na ndị ọrịa a metụtara. N'ime ọnụgụgụ niile ndị nwere ọrịa a, pasentị 81 nke kachasị sị n'Edo steeti. Edo steeti bụ kwa ebe e nwere ụlọọgwụ pụrụiche na-ahụ maka nyocha n'ọgwụgwọ ịba lasa a n'obodo Irrua. Akụkọ ga-amasị gị:" 45248179,https://www.bbc.com/igbo/45248179,Babcock University: Nwoke kwuru okwu asị megide Ndigbo abụghị onye ọrụ anyị,"Ọnụ na-ekwuru mahadum Babcock bụ Joshua Suleman, depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'aha mahadum sị na nwoke ahụ abụghị onye ọrụ mahadum ha.","Ụmụ Igbo na-ewe iwe okwu asị megidere ha Alaba Ajibola, onye kpọrọ onwe ya onye ọrụ Babcock n'igwe okwu Facebook, bidoro iwu na soshal midia ka ọ depụtachara okwu asị megide Ndigbo abalị ole na ole gara aga. N'ihe Ajibola dere na Facebook n'otu a kpọrọ 'Space for Change', o kwuru na ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na e gbuchara Ndigbo niile n'agha Biafra; na ọ bụrụ na ọ dị etu a, Naijiria gaara aga n'ihu karịa. Ọ sị na nsogbu agaghị n'ihu Naijiria si n'aka Ndigbo. N'okwu ya, ""Ekwuola m ọtụtụ mgbe na Ndigbo bụ nsogbu ala anyị. ""Ọ bụrụ na e kpochapụrụ ha n'oge agha Biafra, Naịjiria gaara aga n'ihu. Mana oge agabeghị. Ha bụ agbụrụ a kpọrọ asị karịcha n'ụwa niile."" Ihe Alaba Ajibola dere na-apụ ụka Iwe pụrụ ụmụafọ Igbo Ahụrụ a Ajibola nyụrụ mere ka obi ọtụtụ ụmụ Igbo na-asụ ka mmiri ọkụ. Ụfọdụ ha kpọrọ oku ka Mahadum Babcock taa Ajibola ahụhụ maọbụ ha kpọpụcha ụmụakwụkwọ ndị Igbo na-agụ akwụkwọ na mahadum ahụ. Ụfọdụ dịka @Tonydazzling kwuru na mahadum ahụ na-akwado ịkpa oke agbụrụ nke mere na ha were onye na-akpa oke agbụrụ dịka Ajibola n'ọrụ. Babcock sị na aka ha adịghị ya Mana Mahadum Babcock agọrọla aka na ụkwụ ha, sị na Ajibola abụghị onyeọrụ ha, nke ha na-akwado okwu ya. ""Nke a bụ iji gwa ọhanaeze na Ajibola a na-ekwu maka ya abụghị onye ọrụ mahadum anyị, nke o ji anọchite anya mahadum a n'ụzọ ọbụla. ""Ajibola bụbu onyeọrụ anyị mana o teela aka anyị na ya anọghịzị. ""O nweghị ihe jikọrọ mahadụm anyị na Ajibola na ihe o kwuru."" Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na,""Babcock bụ mahadum mbaụwa maka mmadụ niile, n'agbanyeghị nkwenye, agbụrụ, ofufe na ndọrọndọrọ ọchịchị onye na-akwado."" Akụkọ ga-amasị gị:" egwuregwu-48084080,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-48084080,Burnley vs Man City: Aguero edowela City n'ụzọ irite iko Premier League ọzọ,Manchester City ka nọ n'ụzọ ịtụ ugo n'asọmpị Premier League nke 2019 ka goolu Sergio Aguero nyere ha mmeri na nzute ha na Burnley na ọgbo egwuregwu Turf Moor.,"Akụkọ dị mkpa taa Igwe Bekee kpọrọ ""goal-line technology"" bu ihe eji kpebie na nrịba bọọlụ Aguero ziri ezi. Nke a goosiri etu ya bu asọmpi siri gaa - Man City abịaghị ka ndị zuru ka emee. Burnley haziri onwe ha ọfụma nke, mana ọ bụ Man City ka mmeri bara n'aka ka onye na-egbu asọmpi ahụ gbuchiri ya. Man City ga-anabata Burnley na be ha, ma gakwuru Brighton n'izu na-abịa. Ha merie asọmpi abụọ, iko ga-abu nke ha. Ndị agha Naịjirịa abaala ụzọ na Gombe Ndị agha Naịjirịa ezipula ndị otu ha na Gombe ka ha kwado mmachi amachiri ngagharị na steeti ahụ kemgbe Satọde. Onye nọchite odeakwụkwọ steeti ahụ bụ James Pisajih sị na nke a bụ ka egbochie ọgbaaghara nwere ike ịsochi ụmụaka ndị Boys Brigade nwụrụ n'izu gara aga. IS ""awakpola"" ndị agha Naịjirịa Otu ọmekataraihe pụụjọ bụ IS sị na ha egbuola ndị agha Naịjirịa mmadụ iri na kpụta otu onye ọzọ na ndụ na Borno steeti ụnyahụ. Ndị omekome a kwuru na ha wakporo obi ndị agha Naịjirịa dị na Sabon Gari bụ nke dị na oteaka Maiduguri bụ isiobodo steeti ahụ bụ ebe ha butere ma mebie ọtụtụ ngwaagha. Ndị uweojii awapoola ndị a na-ache na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe n' Sri Lanka N'ofesi e, ndị uweojii obi dị inu awakpoola ọdọ ndị omekome bụ ndị ha sị na tụrụ ogbunigwe gburu ọtụtụ mmadụ na Sri Lanka tata bụ ụka. Gọọmentị mba ahụ amachiela ya bụ otu akpọrọ Thawheedh Jamaath na be ha. Gee Nkeji abalị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri a Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ Akụkọ ga-amasị gị" 43105668,https://www.bbc.com/igbo/43105668,Winter Olympics: Lizzy Yarnold bụ onye mmerị asọmpi Skeleton,Emechaala asọmpị ọsọ skeleton winta olimpiks nke nwa Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo so na ya.,"Jacqueline Loelling, Lizzy Yarnold na Laura Deas bụ ndị mmerị na asọmpị Skeleton Lizzy Yarnold nke Britain ritere ọlaedo, Jacqueline Loelling nke Germany ritere ọlaọcha, ebe Laura Deas nke Britain ritere ọlanchara. Adeagbo bụ nwaaafọ Naịjirịa kpetere azụ n'oso nkwado anọ ha gbara tupu agbaa ọsọ ikpeazụ nke asọmpi a. Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekele Simidele Adeagbo maka mbọ ọgbara i so na asọmpị a. Atiku Abubakar bụ osote onye isi ala Naịjirịa n'oge garaaga Mohammadu Buhari Chete na Simi ji ọnwa anọ we mee nkwado asọmpị nke a. Seun Adigun, Ngozi Onwumere, Akuoma Omeoga na Simidele Adeagbo bụ ndị mbụ na nọchite Naịjirịa na winta olimpiks. Ndị otu Naịjirịa ọzọ na asọmpi oyi bụ winta olimpiks bụ Seun Adigun, Ngozi Onwumere na Akuoma Omeoga bụ ndị egwuregwu Bobsled. Ha ga-ebido ọsọ nkwado ha n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Febrụwarị." afirika-49625275,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49625275,Joel Kachi Benson: Nwaafọ Igbo ejirila akụkọ ụmụakwụkwọ Chibok rite nturuugo na mba ofesi,Ihe nkiri Joel Kachi Benson mere maka ncheta afọ ise a tọrọla ụmụakwụkwọ Chibok enyela ya nturuugo na mba ofesi.,"Joel Kachi Benson sị na ọ dị ya ka ọ na-arọ nrọ Ihe nkiri ahụ a kpọrọ ""Daughters of Chibok"" ritere ""akụkọ VR kacha mma"" n'ọgbọ nturuugo ndị ihe nkiri e mere n'obodo Venice dị na mba Itali. End of Instagram post, 1 Benson gara n'ihu kọwaa etu o si si n'ebe ikpofu ahịhịa bụrụ onye e buliri elu na onye ụwa kpụ n'ọnụ taa. Lee mgbe a ga-eli Mugabe E gburu ihe karịrị mmadụ 100 n'ọgbaaghara dara na ndọrọndọrọ ọchịchị nke wepuru Mugabe n'ọkwa mana ọ na-eme mkpesa na ndị ọcha na-achọ ịchutu ya n'ọkwa. Ndị mba Zimbabwe ekwuola na a ga-akwa Robert Mugabe bụ aka chịburu mba ahụ n'ụbọchị 14 tupu e lie ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 2019. N'akwụkọ ozi ha kesara nye ndị nnọchiteanya ndị mba ọzọ, ha kwuru na a ga-akwa ya dịka e si akwa onye chịburu mba ha nke Bekee kpọrọ ""state funeral"". A ga-kara ya ụka e ji akwa ya n'ọgbọegwuregwu dị n'isiobodo Harare. Omo-Agege bu ụkpa ekele bịa Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu Ovie Omo-Agege bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ekeleela ndị Delta sentralụ bụ ndị ọ na-anọchite anya ha nakwa ndị Naịjirịa. O kelere ha maka ikwado ya dịka ụlọikpe e hibere maka ihe ndapụta na ntuliaka nyere ya mmeri n'oche ya ọ na-azọ. Trump akagbuola nzukọ ya na Afganịstan Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akagbuola nzukọ nzuzo ya na onyeisi mba Afghanistan na ndị Taliban kwesịrị inwe gbasara ịkpa etu agha dị n'etiti mba abụọ ahụ kemgbe afọ iri na asatọ ga-esi ebi. Ọ kagburu nzukọ ahụ makana ndị Taliban kwetere na aka ha dị na mwakpo gburu otu onye agha Amerịka nso nso a. Otu bọolụ nkata Naịjirịa ga-aga Olimpiks 2020! Ndị otu bọọlụ nkata Naịjirịa awụferela ebe ha ga-eso zọọ asọmpi Olimpiks nke a ga-eme na Tokyo n'afọ 2020. Naịjirịa meriri Chaịna na mba ha taa, nke mere ka ha zọta naanị otu oche na-eru Afrịka n'asọmpi a. 'Anyi adịla njikere ka anyi na Ipob nwee nzukọ' - Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ Ndi gọvanọ ọwụwa anyanwu ekwuola na ha enweghị ikike imachị ndi Ipob kama na ọ bụ emume ha ka ha machiri. Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru sị na ndị Govanọ ọwụwa anyanwu adịla njikere ka ha na ndị Ipob nwee nzụkọ ka ụdo were chịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Umahi kwuru nkea n'ụbochị Tọzde ma si ka ndị Ipob hibe ụbọchi na ebe ọbụla ha chọrọ ka ha na ndị Gọvanọ nwee nzuko na ndị Gọvanọ ga-abia. Ọ kwukwara na ha na ndị Ipob bụ umunne na ihe kacha mma ugbua bụ ka ha na Ipob nwee nzụkọ. Nke a na-abịa dịka ndị Ipob degara ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu akwụkwọ n'ụbochi Wenezde ebe ha kwuru ihe ha chọrọ ka gọọmenti mee nke gụnyere iwepụ mmachi amachiri Ipob, ma kwe ka emume gbasara Biafra na-aga n'ihu n'ọwụwa anyanwu niile. Ngagharị ndị Shia ga-eme n'ụbọchi Tuzde ' Anyị anaghị agwado ọgụ, anyị ji ụdọ eme ngagharị anyị ' IMN Otu gọọmenti Naijiria machiri amachi bụ Islamic Movement of Nigeria (IMN) eji Shia mara, amaala ndị uweojii aka n'ihu ma kwuo na ha ga-eme ngagharị ncheta ọnwụ Husayn Ibn Ali n'ụbọchi Tuzde na agbanyeghi mmachi amachiri ha kama ya rie isi ha. Ọnụ na ekwuchitere ndị Shia bụ Ibrahim Musa kwuru na ndị Shia ụwa niile na-eme ngagharị a, na nke ha agaghị apụ iche. Musa kwuru na ngagharị ha agaghị enwe ọgba aghara ọbụla n'ihi na ụmụ ha na nwunye ha ga-eso. N'aka nke ọzọ , ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba zahachiri ha ma kwuo na ha nwaa ya ka ha hụ ihe oku ji ntị oke eme. Xenophobia: 'Onweghị ihe ga-eme ụloọrụ ndị Saụt Afrịka dị na Legos' - Sanwo-Olu 'Anyi na ndị uweojii ga-akpa ihe a ga-eme ndị soro mee mwakpo ụloorụ ndi Saụt Afrịka Gọvanọ Legos Steeti bụ Babajide Sanwo-ọlụ akatọọla mwakpo awakporo ụlọọrụ ụfọdụ ndị mba Saụt Afrịka dị na Legọs. O kwuru na ọ nyere iwu ka ndị nchekwa niile na Legos mee ihe niile ihu na enwere nchekwa ụloorụ ndi Saụt Afrịka niile dị na Legos. Akụkọ anyị na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'Ofesi Ihe dịka ndị agha ruru 14,000 nke mba Amerịka nọ n'Afghanistan Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ kagbuola atụmatụ ikpe udo Amerịka na ndị otu Taliban nwere na Afghanistan dịka ndị otu ahu kwuru na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe gburu otu onyeagha Amerịka n'ụbọchị Tuzde. Trump Kagbukwara nzụkọ ya na ndị isi Taliban na ọnyeisiala Afghanistan bụ Ashraf Ghani kwesiri inwe n'ụbọchi Sọnde. N'Egwuregwu Iko 'Grand Slam' nke 'US open 2019' abụrụla Serena Williams ọ nọ nso eru aka dịka Bianca Andreescu nke Kanada gbara afọ 19 meriri ya n'agba nke ikpeazụ nke asọmpi a. Dika ọ dị ugbua, nke a bụ ụgboro ano a na-emeri Williams n'agba nke ikpeazụ n'iko 'Lawn Tennis.' Lee akụkọ ga-amasi gị Lee ihe nkiri ga-amasi gị Igbo Language: Lee aha Igbo ndị mmadụ kpọrọ 'Graduate'" afirika-49336082,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49336082,Fr Mbaka: Onweghi mgbe m ji buo amụma ọbụla banyere October 1,Ụkọchukwu ụka Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka agọrọla aka na ụkwụ ya maka amụma a sị na o buru gbasara Ọktoba 1.,"Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ọtụtụ akụkọ kwuru na Mbaka buru amụma ọjọọ na-ekwu na oke mmiri ozuzo, egbeigwe nakwa ọchịchịrị ga-adakwasị obodo Naịjịrịa. Akụkọ ndị ahụ kwukwara na Mbaka buru amụma na oke iwe Chineke ga-adakwasị onyeisiala Muhammadu Buhari, ma kwuo na ya ga-eyipu uwe ụkọchukwu ya ma ọ bụrụ na amụma ndị ahụ emezughi tupu abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba. Mana n'ozi Mbaka zipuru n'akara Facebook ya bụ ""Adoration Ministry Enugu Nigeria -AMEN"", o kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ okpotokpo asị. Mbaka kwuru na ụlọekpere ya anaghị enwe ekpere n'ụbọchị Tọọzde dịka akụkọ ndị ahụ siri kwuo. O kwukwara o nweghị mgbe ọbụla o ji buo amụma ọbụla gbasara onyeisiala Buharị maọbụ October 1, maọbụ kwanụ iyipu uwe ụkọchụkwụ ya. Ọ jụrụ sị: ""Gịnị mere ndị mmadụ ji ebutere onwe ha abụmọnụ nakwa ọbọ Chineke?"" Fr. Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 Ụkọchukwu Mbaka bụ onye a ma ama na-akwado onyeisiala Buhari. Mana o kwuola n'oge gara aga, na ọ gaghị egbu oge ọbụla ịtụ onyeisiala mmehie ya n'ihu ma o mejọọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka" afirika-57126338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57126338,Southeast attacks: 'Anyị anwụchiela ndị ESN gburu onye otu anyị ma nara ya egbe n'Imo' - Ndị Uweojii,Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ ise ha na-eche na aka ha dị n'ogbugbu onye uweojii aha ya bụ Joseph Nwaka.,"Ha sị na ha natakwara ha egbe akpụrakpụ na mgbọ ha ji akpa mkpamkpa a. A nwuchiri otu n'ime ndị a aha ya bụ Onyekachi Mmadufo n'abalị iri na atọ nke ọnwa Mee. Ha kwuru na ya bụ nwa amadị a sara asịsa na ya so na ndị otu Ipob/ESN bụ ndị gọọmentị Naịjiria machiri dịka ndị omekatara ihe pụọ ụjọọ. A na-ebo Mmadufo ebubo ịgbakọ aka ọnụ were wakpo ndị uweojii na steeti ahụ mgbe gara aga. A napụtara Mmadufo egbe AK47 akara ya bụ 56-258115 na mgbọegbe iri na ise. N'asịsa ya, Mmadufo kwetere na aka ha dị mwakpo ndị uweojii dịka ndị uweojii dere n'akwụkwọ ha zigaara ndị ntaakụkọ. N'otu aka ahụ, ndị uweojii Imo steeti sị kwa na e jidere mmadụ ise ndị ọzọ n'Amanato dị n'Okpuruọchịchị Isu n'abali iri na anọ nke ọnwa Mee. Ha sị na ya na ndị isiekwe ọnwụ a kwakọrịtara mgbo tupu ha ejide ndi a. Ha sịkwa na ha jider egbe anọ na mgbe isii n;aka ndị a, Ha sị na nnyoch ka na-aga n'ihu gbasara ndị otu a nakwa ọrụaka ha. Chete na ndị omekome amaghị ndị ha bụ na-ebuso gọọmentị Imi steeti agha ihe karịrị otu ọnwa ugbua." afirika-49631016,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49631016,South Africa Attacks: 'Anyị agaghi eti ndị si Saụt Afrịka lọta aka n'obi' Gọọmentị Naịjirịa,Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ mba ofesi bụ Abike Dabiri ekuola na gọọmenntị etiti agaghị eburu ibu ndị sị mba Saụt Afrịka gbalata maka ogbugbu mmadụ na mmebi akụnaụba ndị mbịarambịara na mba ahụ.,"Dabiri-Erewa gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ihe onye nnọchịteanya pụrụiche Onyeisiala Muhammadu Buhari zigara Saụt Afrịka gwara ya ga-ekpebi ihe gọọmentị ga-eme. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ mba Saụt Afrịka ka gọọmentị Naịjirịa ji n'aka maka arụ a emere n'ebe ahụ. Onyeisiala Buhari ga-enwete mkpesa nke onye nnọchite anya pụrụiche ahụ bụ Afrịka bụ Ahmed Rufai Abubakar taa. Onyeisiala Buhari gosiburu na obi adịghị ya mma maka mwakpo ikpa oke a na-awakpo ndị Naijirịa bị na Saụt Afrịka. O zigara Ahmed Rufai Abubakar bụ onyeisi ndị uweojii nyocha nke Naijiria ozi na mba Saụt Afrịka nke gunyere ka ndị mba Saụt Afrịka tinye uche ikwusi mwakpo ikpa oke. Ndị ntorobịa mba Saụt Afrịka ka na-ekwusi ike na ha achọghịzi ndị mbịarambịara na be ha. Ndị nnọchite anya Naịjiria na mba Saụt Afrịka na-ekwu na ihe karịrị mmadụ narị isi egosila mmasị ha iso ụgbọelu nke ụlọọrụ Air Peace wepụtara maka ibulata ndị mmadụ Naịjirịa. Onyeisi ụlọọrụ nnọchiteanya Nigeria na obodo Johannesburg bụ Godwin Adama kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị News Agency of Nigeria nwere n'ekwentị. Adama kwuru na ndị mmadụ ka na-edenyekwa aha ha ịhapụ Saụt Afrịka lọghachi Naịjirịa n'ihi ọgbaaghara sitere n'ịkpa oke agbụrụ. N'otu aka ahụkwa, onye ji ọkwa Kọmishọna di elu nke Naịjiria na mba Saut Afrịka bụ Kabiru Bala, kwukwara na ihe niile na-aga n'anya ya. Bala kwuru na ""ọtụtụ ndị denyere aha ha ịlọghachite Naịjiria enweghi akwụkwọ njem zuruoke."" ""Anyi na-eleba ya anya. Ndị akwụkwọ ha ezughi ezu, anyị ga-enye ha akwụkwọ gbanụ gbanụ, ka ha wee mee ya bụ njem."" Cheta na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụ iche na soshal midia ""Facebook"" n'ụbọchị Satọdee gbasara ọgbaaghara ""Xenophobia"" na mba Saụt Afrịka. Mana n'ụbọchị ụka, ọtụtụ ndị ntorobịa na Saụt Afrịka mere ngagharị iwe, na-ekwusi ike na ha achọghizi ndị mbịarambịara ọbụla na obodo ha. Ndị otu MASSOB MASSOB boro Gọvanọ Dave Umahi ebubo ikpa nkata megide ọdọugboelu Akanu Ibiam Ndị otu MASSOB agbarụọla ihu maka mgbachi agbachiri ọdọugboelu nke Akanu Ibiam Enugwu steeti na-enyeghị oge a ga-arụcha ya maọbụ ego ọle a ga-eji rụo ya. Massob kwuru na nyocha ha gosiri na Gọvanọ Dave ụmahị na Onyeisiala Buhari na-akpa nkata iji wetuo ọnọdu ọdọụgbọelu ahụ ka ọ bụru nke anaghị efepu ụgbọelu na-aga ofesi. Okorocha na Ihedioha ka na-alụ Aka chịburu Steeti Imo bụ Rochas Okorocha agwala gọvanọ Emeka Ihedioha ka ọ taa odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Uche Onyeagaocha ahụhụ maka ịkpọ oku ka anwụchie ya. Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuru Okorocha kwuputara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị ụka. O kwuru na oku ahụ Onyeagaocha kpọrọ adabaghị adaba n'iwu ma ncha N'Ofesi Ndị na akpọ ụgbọelu gbara abụbụ ọrụ maka ha chọrọ ka etinyere ha ego n'ụgwọ ọnwa ha Ndị ụlọ ọrụ British Airways akwusịla njem ụgbọelu ha niile dịka ndị na anya ụgboelu ha gbara agbụru ọrụ abalị abụo maka ụgwọ ọnwa. Nkwụsị njem a metutara ndị njem rụrụ out narị puku na puku iri itolu na ise. Ebelebe egbuola na Tokyo Ajọ ikuku a kpọrọ ""Typhoon Faxai"" kụjara obodo Tokyo, isi obodo Japan. Na mba ofesi, ajọ ikuku na oke mmiri ozuzo nke mere na mba Japan emeela ka ụlọ karịrị puku narị itoolu nọrọ na-enweghị ọkụ Latrik. Ihe ọdachị nke a mere n'obodo Tokyo mekwara ka a kagbuo njem ụgbọelu karịrị otu narị na iri atọ. Otu nwanyị gbara afọ iri ise (50) maọbụ karịa gharịpụrụ mgbe ikuku buuru ya kụọ ya isi n'ahụ aja. O mechara nwụọ n'ụlọọgwụ. Odogwu Rafael nwa Nadal Rafael Nadal makụrụ iko US Open ka nwa. N'egwuregwu, Rafael Nadal gosiri ihe o ji bụrụ odogwu mgbe o meriri Daniil Medvedev nke mba Rọshia iji wee mabulie iko nke US Open n'isi ụtụtụ taa. Asọmpi were awa anọ na nkeji iri ise tupu apịachaa ya. Ka ọ dị ugbua, ọ fọdụụrụ Nadal otu iko ""major"" ọzọ ka ya na Roger Federer hara na ndị kacha bute iko ""major"" n'egwuregwu tennis. Cheta na nwata nwanyị aha ya bụ Bianca Andreescu meriri Serena Williams na asọmpi US Open nke ụmụnwanyị a pịara n'ụbọchị Satọdee. Azubuike Egwuekwe abanyela Rivers United nke Naịjiria Ọgbaa bọolụ otu Super Eagles bụ Azubike Egwuekwe esirila otu egwu bọolụ Al Nasr Benghazi nke Libya were banye Rivers United nke Naijirịa. Egwuekwe so na ndị otu Super Eagles nke meriri asọmpị Ikọ mba Afrịka nke afọ 2013 na Saụt Afrịka. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gee nkeji akụkọ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkịrị ga-amasị gị Nwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ" afirika-46667279,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667279,Christmas Message: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike',Ị nọ n'ụlọ gị ugbua enweta ezumike? Mara na enwere ndị ọrụ ha ekweghị ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.,"Na ndị mmadụ na-ala ụlọ ekeresimesi maọbụ na ha nọ n'ụlọ maka ezumike a kpọrọ ""public holiday"" abụghị maka ọtụtụ n'ime ndị na-arụ ọrụ ndị a. Ya mere, ka ị na-ekpori ndụ gị na-enwe aṅụrị, cheta na enwere ndị nọ ebe ha nọ na-eme ka ụbọchị na-aga were were na ndụ ndị mmadụ. Otiegwu a ma ama bụ Olamide chetakwara ha. Ebe o si ""ka njọ"" bụ na ọrụ ha enweghị nkwụsị, ọ bụ ọrụ a na-arụ ụbọchị asaa n'ime otu izu. Ị nwere ike ịlelị ha anya, mana ị ma ụdịrị uru ha bara ọkachasị n'oge ezumike a? BBC chọrọ ịkọwapụta ụfọdụ n'ime ha: 1) Ndị ọkwọụgbọala/ọgbatumtum: Kedụ ụzọ ọzọ ị ga-esi gazuo ebe niile na-agụ gị ịga maọbụrụ na ị nweghị ụgbọala? Ọ bụ ndị ọkwọụgbọala maọbụ ọgbatumtum ga-ebuga gị ebe niile ị chọrọ ịga. Ọ bụrụzịkwanụ na ha chịba ụkwụ n'ụlọ sị na ha nọkwa n'ezumike dịka ị si nọrọ, ị mara na ị ga-abụzị oji ụkwụ aga Aba. 2) Ndị ọrụ nchekwa: Ndị uweojii, ndị agha na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ichekwa obodo kwara akpa ha lawa n'ụlọ kwuo na ha na-emechi ọrụ maka ezumike, kedụ onye ga-elekọta obodo? Ndị ọrụ nchekwa anaghị emechi makana oge niile, anya kwesịrị iru ha ala n'ihe na-aga ebe niile, ka ọgbaghara ghara ịdapụta. Ọrụ ha gụnyekwara ịhụ na ị labara n'udo, ma hụ na anya gị abụọ mechiri ọfụma ka ị na-arahụ ụra. 3) Ndị ntaakụkọ: Ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ ghara ịrụ ọrụ, kedụ etu ị ga-esi mara ma a sị ""ngwanụ gbafuonu""? Ọrụ ndị ntaakụkọ dị ezigbo mkpa makana etu ahụ ka ị ga-esi mara ihe na-eme n'akụkụ gị nakwa na mbaụwa. Ndị ntaakụkọ na-agba mbọ ịhụ na ka ị gbanyere ihe onyonyo maọbụ redio gị, na ị ga-ahụ ihe ị ga-ele maọbụ gere na ya Ebe o si kara ndị na-arụ ya mma bụ na e nwere ike irụbiri ya arụbiri, nke bụ na ị rụtụ obere, onye ọzọ arụtụkwa obere, mana akụkọ ga-agarịrị n'ihu. Ma ndị na-arụ na redio, ihe onyonyo, ndị na-ede ede, ndị na-agụ agụ, onye ọbụla na-apụta n'ọgbọ n'agbanyeghị ụbọchị ọ bụ. 4) Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ: E kwesịrị ichetara gị uru ndị dọkịta na nọọsụ bara na ndụ mmadụ? Ọrụ ha anaghị ama mgbe bụ ụtụtụ, abalị, maọbụ ụbọchị ezumike, n'ihi na ha ga-anọ ya ma mmadụ anọ n'ogige ha maọbụ anọghị, makana anaghị amacha mgbe ihe ga-ebute mmadụ. Kedụ ebe ị ga-aga ma enwee ka ahụ si eme gị ka ị na-ekpori ndụ? 5) Ndị na-arụ n'ọdọụgbọelu: A ga-asị ndị mmadụ emela njem ụgbọelu n'ihi na ""ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ezumike""? Ị mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-emerịrị njem, mana kedụ onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ị mere njem ụbọchị kwesịrị ịbụ nke ezumike? Ọdọụgbọelu na-arụgide ọrụ ma n'ụtụtụ ma n'abalị Ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu; dịka ndị ọkwọụgbọelu, ndị na-elekọta ndị mmadụ n'ime ya nke Bekee kpọrọ ""air host/hostess"", ndị injinia ọrụ ha bụ ilekọta ụgbọelu tupu o felie nakwa ndị ọzọ ọrụ ha bụ ịhụ na njem gị n'ụgbọelu ga-aga ọfụma. 6) Ndị na-ere nri: Eeh! N'ezie ọ na-akara ọtụtụ ndị mma isi nri ha ga-eri n'ụlọ ha, mana kedụ maka ndị na-enweghị ohere ahụ? Kedụkwanụ maka ndị na-apụ ọrirị ebe a na-ere nri dịka ụlọ oriri na nkwari na nke Bekee kpọrọ ""fast food joint""? ""Nri bụ ndụ"", ndị na-ere nri ma nke a, ya mere ha ji azọ ndị mmadụ ndụ site n'ire nri ma n'ụbọchị ezumike o, ma n'ụbọchị nkịtị. 7) Ndị ọrụ gbatagbata: Ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ ọgbụgba, ndị ọrụ ha bụ ịzọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede nakwa ndị ọzọ na-arụ ụdịrị ọrụ ndị a, anaghị achịba ụkwụ n'ụlọ. Ha na-aga ọrụ makana ụdịrị ọdachi a nwere ike ịdapụta. 8) Ndị nchekwa ụlọmkpọrọ: Ha laa ezumike, onye ga-echekwa ndị nọ n'ụlọmkpọrọ? Ọrụ ha bụ ịhụ na ndị a tụrụ nga agbafughi ga kpaa mkpamkpa, ya mere ha ga-anọ ya site n'ụtụtụ ruo n'abalị, ịhụ na ihe ndapụta adapụtaghị. Ka mmadụ ghara ikwu ""aka m adịghị n'ihe mere"". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Christmas Carol: Lee etu ndị dara ogbi si a bụ abụ ekeresimesi" afirika-48142441,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48142441,Abia state: Ịga steeti a ga-agụ gị agụụ ma ị gụchaa akụkọ a,Kedụ ihe ndị ị nụrụla maka Abịa steeti ma nke ọma ma nke ọjọọ?,"Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ndị ga-asị gị ""tụfịakwa! Enweghi m ike ibi na steeti a"", mana ọ bụ makana ha amaghị na e nwere uru dị n'ibi n'ime ya. BBC Igbo chọrọ ịtụpenye gị azụ gbasara ihe ndị ga-agụ gị agụụ ibi na steeti ọma a a na-akpọ ""steeti nke Chukwu"". 1) Azụmahịa: E nwere ike ikwute okwu Abịa steeti ghara ibu ụzọ ekwu okwu azụmahịa? Ndị obodo ejighi iji ego achụ ego egwu egwu, nke kpatara na ha nwere ọtụtụ ahịa na-ekwo ekwo ma na-ewu ewu. E nwee ka ị si fugide ụzọ hụ onwe gị n'ime Arịarịa, Ahịa ọhụrụ, Isi gate maọbụ nke a na-akpọ ""shopping center"", dịrị njikere ibupute ego gị zụọ ihe dị iche iche mara mma. 2)War Museum/Ojukwu Bunker: Ị bụrụ onye Igbo na-amaghị maka akụkọ agha Biafra, Abịa steeti ga-enyeju gị afọ n'ihe gbasara ya. Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu Ị gaa na War Museum dị n'Ụmụahịa, ị ga-ahụju anya. Site na ngwaagha ndị Igbo ji lụọ agha ahụ, nakwa ebe Odimegwu Ojukwu bụ ọchiagha bi n'ime ala mgbe agha a birila ọkụ, ihe ga-eju gị anya juru n'ime ebe ahụ. 3) Nrụpụta ihe: Ndị Abịa bụ ndị na-emegharị aka ma a bịa n'ịrụpụta ihe. 'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ' Ọ ga-ara ahụ ịhụ ihe ị na-agaghị arụnwu n'Aba dị n'Abịa, nke mere ka ụfọdụ ndị na-akpọ ha ndị ""Chaịna nke mpaghara Afrịka"". A bịa n'akwa, ha nwere 'faktrị', a bịa n'ịrụpụta akpụkpọụkwụ, ha bụ dachịị. 4) Ọgbọegwuregwu Enyimba: A ga-akọwa akụkọ Aba ghara ikwute okwu ndị otu egwuregwu Enyimba? Ha so na ndị na-ebutere Abịa steeti, ọkachasị Aba, aha ọma. Enyimba maburu iko Champions League nke mba Afrịka n'afọ 2003 Ha na-akpakwa ike n'egwuregwu ma na Naịjirịa ma na mba Afrịka. Ọgbọegwuregwu ha dị n'Aba so na ndị e ji eme ọnụ na Naịjirịa. 5) Akwaete: Ị makwa na ọ bụ ndị Abịa steeti na-eme akwa akwaete? Akwaete so na njirimara ndị Igbo, nke e ji eme ọnụ. 6) Okwu e ji mara ndị Aba (slangs): Kedụ ndị kacha atụpụta okwu ndị ahụ na-atọwa ntị ndị Igbo na-eji akpa nkata? Ndị Aba ga-eji okwu kpọfee gị oge ọbụla, ma na mma ma na njọ. Okwu ndị dị ka ""nwanne gbara ọgwụ gị ṅụọ"", ""udo ma akwa"", ""a na-akọrọ onye ọcha?"" na ndị ọzọ, nwere ike ịkpa gị ọchị maọbụ kpasuo gị iwe. Onye Aba achọghị ịma, ọ ga-ekwu ka ọ ha ya n'ọnụ. Kedụkwanụ maka ""Aba nọọ jii, Aba ajụ""?, kedụkwanụ ndị e ji ""ndị yọk"" mara?" afirika-50179476,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50179476,Anambra state budget: Ha ga-emefu N137.1b n'afọ 2020,Nke si Anambara steeti eru anyị ntị bụ na ụlọomeiwu ha ebinyela aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020.,"Obiano kwụnyere Rita Maduagwu Ha na-atụ anya na a ga-emefu ijeri otu narị na iri atọ na asaa na ụma. Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugu state Nnukwu ọdachi gaara ata isi ọtụtụ mmadụ bụ nke e gbochiri n'ụtụtụ taa oge tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsachaa ihe o bu n'ebe ụzọ adịghị mma n'Ọnyeama dị n'Enugwu. Ebe o si dị mma bụ na ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti jiri akụrụngwa Kemịkal eji egbochi ọkụ wụsasịa n'elu ya bụ mmanụ ụgbọala na-awufu nke mere na ọkụ amaliteghị gbawa. Gụọ ya n'uju ebe a: Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugwu steeti Onye agha egbuola ndị otu ya Arụ mere dị ka otu onye agha tụtụrụ egbe gbagbuo ndị otu ya asatọ ma merụọ abụọ ọzọ ahụ na mba Rọshịa. A mabeghi ihe kpatara, mana a na-ekwu na ọ dị ka isi ezuchaghị ya oke. N'egwuregwu, Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi na ndị otu ya bụ Leicester city ga-ezute Southampton na Premier League. Amụmammiri egbuola ehi asatọ ọzọ n'Ondo steeti Egbeigwe agbagbuola ehi asatọ ọzọ n'ugwu Oyinmo Quarter, Ikare Akoko, nke dị n'okpuruọchịchị Akoko Nọt n'Ondo Steeti. Femi Joseph bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na nchọpụta amalitela ka amara ebe mmiri sị baa opi ụgbọghụrụ. Mana onyeisi ndị Myetti Allah steeti ahụ bụ Garuba Bello sị na ya bụ okwu erubeghị ya na ntị. Nke a na-eme ha ehi iri atọ na isii (36) nwụburu na okpuruọchịchị Ifedore nke steeti ahụ ọnwa gara aga. BBC nụrụ na ndị ọchịehi nwe ya bụ ehi ndị nwụru mere ngwa ngwa resi ya ndị na-egbu anụ n'obodo ahụ, dịka onye Femi Joseph sị kwuo. Ọ sị na aka ndị uweojii akparalarị ndị ogbuanụ mmadụ anọ na otu onye ọchị ihe mere ihe ahụ. NLC akwadowala maka ụgwọ opekatampe Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ Otu ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress ekwuola na ndị otu ha nọ na steeti dị iche iche ga-enwete ntụzịaka ha na gọọmenti steeti ha ga-esi nwee nkwekọrịta ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe. Amaechi Asuguni bụ onye nọchite anya onyeisi otu a gbara ama a mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ọgbakọ ha nwere n'Enugwu ụnyahụ. Nke a na-eme ka gọọmentị na ndị otu ọrụ a kpebiri maka ụgwọọnwa ahụ tọzde gara aga n'Abuja. Ọ gachaala abalị 182 gọọmenti etiti tinyere aka maka ya bụ ụgwọ opekatampe tupu e nwee ya bụ mgbebi. bụ ebe ha nọ kwete iji pasenti 23.2 bulie ụgwọọnwa ndị nọ n'ogogo nke asaa, jiri pasenti iri na abụọ bulie nke ndị nọ n'ogogo nke asatọ. A ga-eji pasenti 19 bugo ụgwọọnwa ndị ọrụ nọ n'ogogo nke itoolu ebe pasent iri na isii ga-eruwe ndị nọ n'ogogo nke 10 na 14. Ọgbakọ ndị gọvanọ ekwuola na ihe ruru steeti iri abụọ dị njikere ịkwụ ya bụ ụgwọọnwa ohuru. Mana Asuguni ekwuola ka ndị otu ha nọ na steeti ghara ịkụ mgbanụ na steeti ha ịnwe nkwekọrịta maka na ndị otu ha ga-ezitere ha ntuziaka ga-enyere ha aka ha na gọmenti ịkwekọrịta. EU na-eche maka ịgbatị oge UK N'ofesi, European Union na-eche ịnwe nzụkọ maka ịnyekwu Briten nwaoge ka ha nwee ike ịkpebi mgbe ha ga apụ na EU. Nke a na-eme dịka ndị omeiwu Briten kwekọrịtara ịme ntuliaka n'ọnwa Disemba. Ọtụtụ ndị omeiwu EU na-eche na ọ ga-adị mma inyekwu Briten ọnwa atọ ka ha were chịkọnata onwe ha maọbụ gbubie ya bụ oge ma ha mee ngwangwa. Mana France chọrọ ka enye ha nkenke oge site na Desimba 31 bụ mgbe e tinyeburu ya. Pepe agbarala isi onwe ya n'Arsenal N'egwuregwu, ama na unu anụla nke kpọtụrụ n'abalị ụnyahụ dịka nwaamadị akpụnaọnụ bụ Nicolas Pepe sị zọpụta Arsenal na ndagwurugwu nke ọnwụ. Pepe nyetere Arsenal goolu abụọ n'ime atọ ha jiri merie Vitoria Guimaraes bụ ndị satara abụọ n'ime ha. Akpụ Pepe n'ọnụ maka na ọ meghị nke ọma na asọmpị nke gara aga, mana ugbua, ọzọrola isi onwe ya. Gee akukọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48987590,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48987590,Ọ bụ sọ sọ mmadụ abụọ n'ime mmadụ asatọ a wụrụ 'acid' ka nọ n'ụlo ọgwụ - Uweojii Anambra,"Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na mmadụ isii n'ime asatọ a wụrụ ""acid"" n'Ugwuagba, Obosi, anatala ọgwụgwọ ma laa be ha.","Ụkọ ọrụ na-ebute nnupu isi n'iwu Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, kwuru na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ St.Martins ka ndị uweojii nọ n'Awada kpọgachara ha ebe ahụ. Dịka o si kwuo, mmadụ asatọ a dabanyere n'ọdachi a ka otu nwoke a na-amatabeghi aha ya maọbụ ebe o bi, na Onyeka Nwachukwu malitere ịkọ ọnụ ebe ha na-azụ ahịa na Mgbuka (ahịa a na-ere akụrụngwa igwe ụgbọala). Ka ọnụ ha na-akọ malitere ịrị ibe ya elu, nwoke ahụ wụrụ Nwachukwu dị afọ 38, Ofili Benjamin dị afọ 32, Ofili Damian dị afọ 42 ""acid"". Ndị ọzọ ""acid"" a metụrụ bụ Okoro Ebuka dị afọ 23, Ekwueme Anayo dị afọ 35, Nnamani Chukwu dị afọ 23, Obiora Chidubem dị afọ 18 nakwa Obasi Solomon dị afọ 24. Haruna kwuru na ndị uweojii ka na-achọ onye kpara arụ a ka anwụchie ya ma gbaa ya ajụjụ. Ha dụkwara ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya ọkachasị ma ha hụ ndị gbara ihe na-edoghi anya na mkpọ, ma kpesa ndị ahụ n'aka ndị uweojii. Wole Soyinka tinyere ọnụ n'okwu Buhari Ọka mmụta Wole Soyinka Ọkammụta Naijiria bụ Wole Soyinka ka na-ekwusi ike na okwu banyere ọrụ nchekwa na Naịjiria karịrị ihe ọchịchị Muhammadu Buhari ga-emenwu naanị ya. Soyinka kwuru nke a mgbe ọtụtụ ụmụakwụkwọ gara ikele ya n'emume ncheta ọmụmụ ya. O kọwara na ọ ga-aka mma ma e nwee ọgbakọ ebe ndị niile ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria ga-anọkọ na-agbanyeghi otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ na ya wee tụọ alọ otu a ga-esi kwọọ onye ukwu wara. Njiji ejiela n'Anambra Oke idei mmiri emebeiela ụlọ ruru narị atọ n'Okpoko nke dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru. Akụkọ kọrọ na ihe ruru mmadụ puku abụọ bụzị ndị enweghi ụlọ obibi ugbua n'ihi ihe ọdachị a dakwasịrị ha. Ndị bi n'okirikiri ahụ na-ayọzị Gọvanọ Willie Obiano ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka tupu mmiri ebukọrọ ha nile. Akụkọ si mba ofesi Jeremy Hunt Onye ode akwụkwọ ukwu na-ahụ maka mmekọrịta mba UK na mba ndị ọzọ bụ Jeremy Hunt amalitela atụmatụ ọzọ iji gbochie mba Iran inwe ogbunigwe 'nuclear'. Hunt na ndị ogbo ya si mba Europe dị iche iche ga-enwe ọgbakọ taa iji mara ka a ga esi were ehihie chọwa ewu ojii tupu chi ejie. Nigeria akwọọla aka tiere ọkụkọ akị Naijiria na Tunisia ga-achịpụ ya iji mata onye ga-abụ onye nke atọ N'egwuregwu, Iko mba Afrịka nke afọ a akwaala ndị otu Super Eagles nke Naijiria dika Algeria ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha ụnyaahụ. Umu Naijiria ga-agbazị mbọ ịgbata ndị nke atọ mgbe ha ga-ezute ndị Tunisia ụbọchị Wenezdee. Gụzuo maka egwuregwu ahụ ebe a: Ọ gwụsịwo! Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-52310786,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52310786,Igbo culture: Ekwensu ọ bụ 'satan' n'ala Igbo?,"Mgbe ị na-ekpe ekpere ma sị ""Chineke napụ ekwensu ike"", Kedu ekwensu nke ị na-akpọ.","Akpụrakpụ ekwensu nku arụsị ekwensu n'Enugwu Ọ bụ nke edere n'akwụkwọ nsọ ka ọ bụ nke ndi nnanna anyi ha na-efe? Eziokwu bụ na ha abụghị otu. Soro anyi na njem a ka anyị mata ihe omenala Igbo kpọrọ ekwensu na ihe ndị ofufe Kraịst kpọrọ ekwensu. Ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion' bụ Chika Okpalike na ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe bụ ndị tinyere ọnụ n'okwu a. Na mbido Ka anyị bido n'akwụkwọ nsọ mgbe onyeozi Pọlụ gara obodo Athens ọ hụru arụsi ndị obodo ahụ kpọrọ ""Chi a na-amaghị"" were jiri ya kọwara ha onye Chukwu bụ. Chika Okpalike ji ya kọwaa na mgbe ndị ofufe Kraist batara ala Igbo. Ha lere anya were chopụta na ndị igbo nwere Chi ha na-efe ha kpọrọ ekwensu. Dịka ọ dị n'akwụkwọ nsọ, onye iro ndị nke Kraist bụ ""Satan"" nke mere ka ndị wetara ofufe kraist were sị na Satan bụ ekwensu. Mazi Chigozie Nnabuihe kọwakwara na n'akwụkwọ nsọ, na Jehova bụ aha ndị Juu n'akpọ Chukwu oge agha ma o bụ oge ihe ike mere. Nnabuihe n'akọwa na njirimara ""Jehova"" yikwara njirimara chi ndị Igbo n'akpọ ekwensu. Ọ kọwakwara na Satan bụ ajọ mụọ ebe ekwensu sọ n'otu chi ndị igbo na-efe oge gboo, ọkachasị oge agha. Kedu onye ndị Igbo na-akpọ ekwensu? Nwoke a na-akpọ onwe ya Eze Ekwensu Okpalike gwara BBC Igbo na mgbe ochie, onye mmadu mejọrọ chọrọ ịbọgwara ihe e mere ya na-ejekwuru ekwensu ka ọ lụọrọ ya ọgụ. Maọbụ ị chọkwaa imesi mmadụ ike na-eleghị anya n'azụ, onye ahụ ga-ejekwuru ekensu n'ihi na ekwensu anaghị eme ebere ma ọ chọrọ imesi mmadụ ike. Ọ kọwakwara na e nwere ndị na-efe ya bụ ekwensu nke mere na a ka nwere ụfọdụ ebe n'ala Igbo n'aza ya bụ aha. Etu m siri bụrụ Eze Ekwensu Okpalike kwuru na e nwere ebe a na-akpọ Ụmụekwensu na Delta steeti ma nwekwaa ndị a na-akpọkwa Ụmụekwensu n'obodo Ngwa dị n'Abịa steeti, enwekwara ugwu ekwensu n'obodo Ụkpọ nke dị n'Anambra steeti, ma nwee kwa ọhịa ekwensu n'obodo Ụga. Ọ kọwara na nke a apụtaghị na ndị a bụ ajọ mmadụ maọbụ ndị a bụrụ ọnụ ma kama na ọ bụ ndị dopuru onwe ha iche ikpere ekwensu kamgbe ochie. Kedu ihe mere ndị ofufe Kraist ji kpọọ ekwensu satan? Nwaada Jane Ada bụ onye ọkpụ ihe, ọ na-akpụkarị arụsị ndị Igbo fere mgbe gboo Ụkọchukwu Chika Okpalike kọwara na ndi Igbo enweghị chi ha na-efe dịka ajọ mmụọ maọbụ 'Satan'. Ọkpalike kọwara na ndị ofufe Kraist amaghị etu ha ga-esi kọwaara ndị Igbo mgbe ochie maka Satan n'ihi na echiche dị otu adịghi na ala Igbo. Kama mgbe ha hụtara na ekwensu bụ chi ndị Igbo na-efe dịka chi na-ebuso agha ma na-akpa ike na emeghi ebere, mgbe ahụ ka ha jizi si na satan na ekwensu bụ otu. O kwukwara na mgbe ọbụla ndị n'agbasa ozi chọrọ igbasa ozi ha n'ebe ohụrụ, ha na-eji chi ndị ahụ na-efe were kọwara ha maka ozioma nke Kraịst. Jane Ada: Nwaada Igbo ji ịkpụ ụzụ na-egosi ụwa arụsị e jiri mara ndị Igbo Enwere etu ndị Igbo si efe ekwensu mgbe ochie? Okpalike kọwara na mgbe ochie, enwere ndị na-efe ma dibia na-elekọta arụsị ahụ bụ ekwensu. O kwukwara na enwere ụzọ aja abụọ nke bụ ""Aja nchụnye"" na ""Aja nchụpụ"". Ọ kọwara na dịka etu ekwensu si eme, na aja a na-achụrụ ekwensu bụ aja nchụpụ nke pụtara na enweghị onye na-eri aja ekwensu. Ihe ị kwesiri ịmata Ihe ikwesiri ịmata n'edemede a dịka ndị ọkammuta sị kowara anyị bụ 1)Ekwensu n'ọmenala Igbo abụghị ajọ mmụọ kama ọ bụ chi ndị Igbo na-efe 2)Ndị ofufe Kraist ji ya akọwara ndị mgbe ochie ka ha nwee ike ịghọta na e nwere satan 3)Ekwensu bụ chi ndị mgbe gboo na-akpọ oge agha, oge mmadụ chọrọ ịbọgwara ihe e mere ya maọbụ mgbe mmadụ chọrọ imesi mmadụ ọzọ ike 4)Ekwensu nwere dibia na ndị na-efe ya mgbe ochie. 5)Etu ikenga, agwu, ibini ukpabi na chi ndị ọzọ dị ka ekwensu dịkwa n'ọmenala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52597576,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52597576,Boko Haram: Gọvanọ Zulum ebugala isi ụlọọrụ ya ihu agha,Gọvanọ Borno steeti bụ Babanga Umara Zulum e nye ntuzịaka ka e buru isi ụlọọrụa ya buga Auno dị na steeti ahụ.,"Auno bụ otu n'ime obodo ndị ọlụọ ọla Boko Haram ji n'ọrụ. Zulum dere nke a n'akara Twitter ya sị na nke a bụ maka ime ka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọrọ nso n'obodo ahụ. Echiche ya bụ na ọnọdụ ha ga-eme ka ndị omekome ahụ rie mbọ mbọ ọsọ n'obodo ahụ. End of Twitter post, 1 E nwere ike ịmachi obodo ọzọ? A ga-etinye mmachibido ịpụta ezi ọzọ ka ọ bụ agaghị etinye? Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa gwara BBC na ọ bụ n'aka onyeisiala ka ọ dị ikpebi ma a ga-emechi ọzọ, ma ọ tụlechaa etu mbuli mmachi si gaa mgbe izu abụọ e buliri ya gachara. Ehanire kwukwara na ọ bụ maka na ha amalitela ịba n'ime obodo eme nnyocha ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ji malite ịrị elu etu ọ dị ugbua. O kwukwara na ọzọ bụ na ndị mmadụ anaghị ekwe erube isi n'iwu ịnọsapụ anọsapụ gọomentị tinyere. O kwuru na ọ bụ ihe dịrị ndị isi obodo na ndị isi ofufe dị iche iche ịkọwara ndị na-eso ụzọ ha na iwu gọomentị tinyere bụ maka ọdị mma ha. Onye anwansị anwụọla Coronavirus egbuola Roy Horn bụ otu onye n'ime mmadụ abụọ e ji ime anwansị mara n'obodo Las Vegas dị na mba Amerịka. Ya na onye otu ya bụ Siegfried Fischbacher bụ ndị ji anụmanụ eme anwansị. Horn dị afọ iri asaa na ise mgbe ọnwụ kụrụ ya aka n'ụzọ. N'egwuregwu, A ga-enwe ike iwebata ihe ruru mmadụ ise ma a na-eme mgbanwe n'egwuregwu bọọlụ mgbe a ga-amalite ịgba ọzọ. Fifa nyere ohere ka nke a mee n'asọmpi ndị a ga-agbachapụ n'afọ a, dịka ha na-ekwukwa okwu ịkwụsị iji ihe onyonyo VAR eme mkpebi maka ahụike ndị na-eledo VAR ahụ anya n'ime otu ọnụ ụlọ. Igwe Umenyiora nke Ogbunike anwụọla Eze ndị Ogbunike bụ Igwe John Ositadimma Umenyiora anwụọla. E kwuputere maka ọnwụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa a, dịka ọ chịrị site n'afọ 1976 ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ a. Ọ nọrọ afọ iri anọ na anọ (44) n'oche eze ndị Ogbunike dị n'Anambara steeti. Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa! Lee ihe nwunye nwa ya dere maka ọnwụ ya: Mmadụ 386 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa Mmadụ narị atọ na iri asatọ na isii ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa, dịka ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe efe bụ NCDC si kwuo. N'ọnụọgụgụ e wepụtara, mmadụ abụọ ọhụrụ butere ya n'Ebọnyi steeti, otu onye n'Enugwu nakwa onye ọzọ n'Imo steeti. Ha kwukwara na mmadụ iri asaa na asatọ ọzọ agbakekwuola, ebe mmadụ iri ọzọ nwụrụ tinyere mmadụ otu narị na asaa ha kpọpụtaburu ụbọchị gara aga. Trump na-agụgụ mmadụ akwa Ndị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu Arbery Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etiela ezinaụlọ Ahmaud Arbery bụ onye a gbagburu ebe ọ na-agba ọsọ, aka n'obi. Trump kwuru na etu e si gbuo nwaamadi a na-arụ afọ, ma kwuo na ndị uweojii ga-etinyerịrị ya anya ma hụ isi ya. Son Heung-Min efeela ala nna ya Son Heung-min na-agbara Tottenham bọolụ abụzị onye army? Son bụ onye mba Saụt Koriya emezuola ofufe ala nna ya dịka onye agha nke ha na-eji izu atọ eme, ma ritekwa nturugo maka ika ndị ọzọ mee ọfụma. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Onye gburu Onyebuchi Rita?" afirika-45874136,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45874136,Hauwa Leman: Otu BBOG na-eme ngagharị iwe n'Abuja ugbua,Ndị otu Bring Back Our Girls (BBOG) a malitele ngagharịiwe na Unity Fountain dị n'Abuja maka ogbugbu ndị Boko Haram gburu Hauwa Leman bụ onye ọrụ nlekọta ahụ so ndị otu Red Cross arụ ọrụ na Borno steetị.,"Boko Haram tọọrọ ndị ọrụ Hauwa Leman na ndị Red Cross ọzọ afa ha bụ Alice Loksha na Saifura Hussaini Ahmed Khorsa n'ọnwa maachị 2018 mgbe ha mere ebe ha nọ ọrụ na ebe ndị gbara ọsọ ndu nọ. N'ime ọnwa Seputemba, Boko Haram gburu Saifura Ahmed Khorsa ma nye gọọmentị Naịjirịa iwu ka ha tọhapụ ndị Boko Haram eji eji maọbụ ha egbuo ndị ọzọ. Mana gọọmentị Naịjirịa emeghi ihe a Boko Haram kwuru rue ụnyaahụ. Ndi omekome a gburu Hausa Leman ma kwuo na ha ga-eme Leah Sheribu na ndị ọzọ ga-abụ ohu n'aka ha. Nke a mere oke iwe jiri ju ndị Naịjirịa obi nke butere ngagharịiwe otu BBOG na-eme ugbua. Onyeisi ha bụ Oby Ezekwesili so na ndị na-eme ngagharịiwe a mana o zoro onwe ka ndị ntaakụkọ ha iseta ya foto ma ọ bụ ị jụ ya ajụjụ ọnụ. Ndị ọzọ na-eme ngagharịiwe a gwara BBC na iwe ha bụ na o nweghi ihe gọọmentị etiti na-eme iji kwụsị ogbugbu ndị atọọrọ. Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe ahụ ị chịkọta ndị na-eme ngagharịiwe. Cheta na ndi Boko Haram ka jikwa Leah Sheribu bụ nwata akwụkwọ Dapchi. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49234166,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49234166,Sowore #RevolutionNow Protest: Ihe ndị ntoroọbịa na-ekwu maka ngagharịiwe a,"Abalị 5 nke ọnwa Ọgọst 2018 ka atụmatụ ngagharịiwe ""Revolution Now"" onye zọbụrụ ọchịchị n'okpuru patị African Action Congress (AAC) bụ Omoyele Sowore hibere kwesiri ịmalite.","Iwe ji nwoke na-abara onye uweojii mba n'ọgbọ egwuregwu Naịjirịa dị na Legọs Ọ bụ na steeti dị iche iche ka ngagharịiwe a kwesiri ịmalite mana ọ bụ sọsọ na Legọs ka e mere ka a ga-amalite ya tupu ndi ọrụ nchekwa etisasịa ndị pụtara. Agbanyeghị na ọtụtụ ndị ntorobịa na soshal midia kwuru na ha kwadoro ngagharịiwe a, nanị mmadụ olemole zọrọ ụkwụ n'ọgbọ egwuregwu a kpọrọ ""National Stadium"" ka chi bọrọ. Nke a na-abịa ka ndị ngalaba nchekwa akpọrọ DSS nwụchịrị Maazị Sowere ụbọchị Satọde. Ọzọ nwereike bụrụ maka na ndi uweojii sị na onye ọbụla pụtara ngagharịiwe a ga-ahu ihe ndị na-agba obodo mgba okpuru na-ahụ. Mana ka o si kwụrụ, ndị uweojii na ndị agha ekweghi ka ndi pụtara atụmatụ a kuru mmiri tọgbọ iko. Ebe e yinyeburu na a ga-esi malite ime ngagharịiwe ""Revolution Now"" na Kano Anwụchịrị ndị anwụchịri ma chụmie ndi ọzọ. E ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime 'Revolution Now' na Lagos. Aka na-achị Rivers steeti bụ Nysom Nwike sọkwa wụọ mmiri oyi n'atụmatụ a mgbe o kwuru na ya achọghị ịnụ maka ya na steeti ya. Mana, ọpụtara na ndị ntoroọbịa akwadoghi ngagharịiwe a? Dr McGinger Ibeneme sị na ọtụtụ mmadụ gbajọrọ ngagharịiwe a n'ihi onye haziri ya. Ndị uweojii na-anyagharị ụgbọala ha na Unity Fountain n'Abuja mana ndị ""Revolution Now"" apụtaghị ""Sowore so n'ime ndị kpọbatara Buhari ma bụrụkwa onye ama na-eme ihe naanị ya."" O kwukwara na okwu gọomentị kwuru banyere ihe a kpọrọ ""Revolution"" na etu a ga-esi hụ ndị so mee ya bụ ngagharịiwe so mee ka ndị mmadụ gbajọọ atụmatụ a. Ejike Kanife bụ onye ntaakụkọ gara ileta ngagharịiwe sị na ọ bụ ụjọ mere ndị mmadụ ji gbajọo ngagharịiwe a. ""Ndị bịara ihe a pere ezigbote mpe. Ha erughi iri abụọ. Ọ bụ ujọ ego ole ha ga-akwụ iji gbapụta onwe ha n'aka uweojii mere ha jiri gbajọọ ya."" Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị ọha na ama anọghị na soshal midia amaghị maka ngagharịiew a. Ndị uweojii na-eche nche ịhụ na ndị mmadụ agbakọghị mee ngagharịiwe n'ihu Isaac Boro Park dị na Port Harcourt, Rivers Steeti ""Ndị nkiti na-agara onwe ha na-ajụ ihe na-eme. Nke a gosiri na ndi na-ekwu maka ihe a bụ sọsọ na soshal midia ka ha na-aba mba."" Ka ọ kwụ ugbua, Maazị Sowoere ka nọ na mkpọrọ, ebe ndị uweojii akpọrọla ndị ha nwụchịrị gawa ụlọọrụ ha. Amabeghi ma ha a ga-aga n'ihu kpụpụ ha ụlọikpe maka ịgba obodo mgba okpuru dịka ha kwuru. Lee etu ya bụ ngagharịiwe siri gaa: Akụkọ nwereike ị masị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" media-44020922,https://www.bbc.com/igbo/media-44020922,Headies 2018: Davido bụ onye kachasị turu ugo,"David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu(artiste of the Year) na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode.","Davido aturuola ọtụtụ ugo na Naịjiria na ọtụtụ ala ndị ọzọ Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' tukwara ugo dịka bụ egwu kachasị mma (Song of the Year), nakwa egwu kacha ewu(best pop song) 'Oge eruola ị nyere ndị oti egwu ka na-apụta apụta aka' N'okwu ya oge ọ na-anara nturugo ahụ, Davido kwuru na oge eruola ndị ụkwa ha kwusiri ike n'iti egwu inye ndị na-apụta apụta nkwalite na nka ha. Ọ sị,""oge eruola inyere ndị otiegwu ka na-apụta apụta aka"". Ndị ọzọ nwetara nntulugo bụ Simi,Wizkid,Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ. Simi na ndị otiegwu ụmụnwaanyị Simi bu onye ama ama maka olu ọma ya puruiche Simi pụtara dịka onye ọkachasị eti egwu n'ime ụmụnwanyị n'afọ 2018. Simi turu ugo onye nchịkọta egwu kachasị mma, onye egwu kachasị ụtọ abụ gbasara ihunaanya na onye ritere 'Best Recording' n'afọ 2018. Simi nupuru Tiwa Sava n'okwa nke a. Ma ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo na mmemme ahụ. Ụfọdụ nturu ugo Davido turu n'oge gara aga Davido na Wizkid bụ ndị aha ha na-ewu ewu ugbua n'agbara ọfụ Davido enwela nzere ruru iri atọ. Ụfọdụ n'ime ha bụ onye okacha eti egwu BET, MTV Africa, Kora, Channel O na Headies. Ọ bụ egwu Davido tiri n'afọ 2011 ọ kpọrọ 'Dami Duro' bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na mpaghara Afrịka marị ya ọfụma ọfụma. Ugbua Davido bụ onye ama ama na mba ụwa niile. Ụfọdụ n'ime egwu Davido bụ Fall (2010), If (2017), Aye (2015), The Sound (2015) na Biko (2016) na ọtụtụ ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị" 42845892,https://www.bbc.com/igbo/42845892,Ihe iri ị na amaghị gbasara ekwentị gị,Ndị nyocha ekwuola na ekwentị na kọmputa bụ ọdị n'ihu ụwa n'ihi na mmadụ niile nwere ntụkwasị obi ebe igwe ndị a dị ọkachasị ekwentị ha.,"Nke a kpatara ndị nyocha jikwara kwuo na ndị mmadụ anaghịzị enwe mmekọ ebe mmadụ niile tinyere anya n'ekwenti ha. Ọnọdụ a eruola na di na nwunye na anọ n'otu imeụlọ mana ha ji ekwenti akpankata karịa igwa onwe ha okwu. Mike Arnold n'igwe mgbasaokwu instagram na-ekwu etu ndị mmadụ si eme ma ekwenti ha fuo. N'aka nke ọzọ ndị ụlọ ọrụ na-emepụta ihe chọrọ ka ndị mmadụ nọrọ n'ekwentị ha oge niile ka ha nwe ike ree ahịa ha kpọsara. Onye ọzọ n'instagram jiri ihe o dere kọwapụta etu ndị mmadụ si etinye uche n'ekwentị ha. O kwuru na ekwentị anaghị ekwe ndị mmaọ̄ụ hie ụra n'abalị nke kpatara na ha ga-eji ekwentị ha n'aka mana ehi ụra. Ihe ndị ị na amaghị gbasara ekwentị gị 1. Etu ahụ si eme ndị na-aṅụ ọgwụ ike ma ha aṅụghị ọgwụ bụ etu o si eme ndị nwere ekwentị. Nke a pụtara na inye nwatakịrị ekwentị dịka inye ya ọgwụ ike. 2. Ekwentị nwere nje ugbo iri na asatọ karịa aka ebe a na-aga mkposi. 3. Radieshhọn si n'ekwentị na-ebute arahụghị ụra, isiọwụwa na mgbagwojuanya. 4. Orịa a na-akpọ ""Nomofobia"" bụ ụjọ itufu ekwentị gị maọbụ na ịgaghị enweta netwọkụ. 5. Ndị mmadụ nwere ekwentị n'ụwa karịa ka e nwere ebe mkposi. 6. Ndị mmadụ na-akpọpe ekwentị ha ihe ruru ugbo otu narị na iri kwa ụbọchị. 7. Mmadụ ruru pasentị iri anọ na asaa bi na mba US kwuru na ha agaghị ebili ma ha na ekwentị ha anọghị. 8. Mmadụ ruru pasentị iri anọ na asaa n'ụwa niile kwuru na ha eji ekwentị ha ma ha achọghị mmekọ mmadụ ọbụla. 9. Ndị mmadụ karịa n'afọ 2015 site na ise foto onwe nke a na-akpọ selfie. 10. N'ime mmadụ ijeri asaa bị n'elu ụwa, nanị mmadụ nde atọ na puku nari ise (3.5m) nwere ihe e ji asa eze mana mmadụ nde anọ (4M) nwere ekwentị." afirika-50226965,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50226965,Operation Positive Identification: Gịnị bụ atụmatụ a ndịagha Naịjirịa chọrọ imalite?,Ihe na-ewu na soshal midia bụ atụmatụ 'Operation Positive Identification' (OPI) nke ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ga-amalite.,"Onyeagha na-enyocha ndị nọ n'elu ọgbatumtum Ọtụtụ kwuru na atụmatụ ahụ bụ ụzọ ndịagha si emekpa ụmụ mmadụ ahụ. Mana otu ihe doro anya bụ na ọtụtụ amachaghị maka ya bụ atụmatụ. Gịnị bụ 'OPI'? Ọ bụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Sepụtemba ka ndịagha kwuru na ha amalitela 'Operation Positive Identification'. N'oge ahụ, ha kwuru na nke a ga-abụ naanị na mpaghara ugwu ebe ndị oyiegwu Boko Haram na-enye nzogbu. Ha kọwara na atụmatụ ahụ bụ iji chọpụta ma nwụchie ndị otu Boko Haram na-ezo ezo. Ha dọkwara aka na ntị ka onye ọbụla bi maọbụ na-eme njem na mpaghara Nọt-Ist jiri akwụkwọ njirimaraonye nke Bekee kpọrọ 'Identity Card' kpagharịwa. 'OPI' ọ ga-agazu Naịjirịa niile? Ndịagha kwuru na atụmatụ 'OPI' ga-agazu Naịjirịa niile. Ha mara ọkwa a n'akara 'Twitter' ha n'abali iri abụọ na ise nke ọnwa Sepụtemba. Ụfọdụ ndị mmadụ malitere kesawa ozi ha sị na o si n'aka ndịagha. Ozi ahụ na-ekwu na 'OPI' ga-agazu Naịjirịa niile. Ndịagha Naịjirịa kwuru na akụkọ gbasara 'OPI' abụghị eziokwu. Ozi ahụ kwukwara na atụmatụ ahụ ga-amalite n'abalị mbụ nke Nọvemba ruo abalị iri abụọ na atọ nke Disemba. Mana ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Sagir Musa, gwara BBC na ozi ahụ bụ ụgha. Ndị omeiwu gbarụrụ ihu maka ya? Onyeisi ụlọomeiwu nta, Femi Gbajabiamila Ndị ụlọomeiwu nta kpọkuru onyeisiala Muhammadu Buhari ka o gbochie ndịagha imalite atụmatụ a. N'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Tuuzde, ụbọchị 29 nke ọnwa Ọktoba 2019, ha kwuru na atụmatụ 'OPI' megidere iwu Naịjirịa. Ha kwuru na inyocha akwụkwọ njirimara ndị mmadụ abụghị ọrụ dịịrị ndịagha. Ndị kwadoro okwu ahụ bụ Ndudi Elumelu na Ahmadu Jaha. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Ọtụtụ ndị mmadụ akwadoghi atụmatụ 'Operation Positive Identification'. @segalink kwuru na atụmatụ ahụ adabaghị chaa chaa. @adeyanjudeji kwuru na atụmatụ ahụ bụ maka ntuliaka a na-achọ ime na Kogi nakwa Bayelsa steeti. @AyoBankole kwuru na ndịagha na-achọ iweghara ebe niile na Naịjirịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: ""Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee""" afirika-50513667,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50513667,France: Ụmụnwaanyi ahụsiela anya n'aka ndị ụtọ ha,"Ọzọ, echi bụ Satọde ka ụmụ nwaanyị ga-eme ngagharịwe na mba France maka oke igbuilu na ogbugbu ụmụnwoke na-egbu ha na mba ahụ.","Ụmụnwaanyị ahụsiela anya na France Ihe ruru ụmụnwaanyị otu narị, iri atọ na asaa anwụọla n'aka ndị ụtọ ha n'afọ 2019, dịka akụkọ kwuru. End of Twitter post, 1 Mba ahụ ga-enwe ọgbakọ maka itinye ọnụ n'okwu gbasara igbu ụmụnwaanyi ọkachasị n'aka ndị ụtọ ha. N'afọ gara aga ụmụnwaanyị 121 nwụrụ n'aka ndị ụtọ ha. Akụkọ ọzọ kwukwara na ihe ruru 217 bụ ụmụnwaanyị gburu onwe ha maka ihe ha na-agabiga n'aka ụmụnwoke ha n'ezinụlọ. Nke afọ a ka njo, nke bụ na isi ụmụnwaanyị dị 137 alaala maka tigbuo zọgbuo dị na ezinụlọ. Kọmishona nlekọta gburu anwụọla n'Imo steeti Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Kọmishona na ahụ maka ọdịmma ugburu nakwa ọnatarachi n'Imo steeti bụ Anthony Okeke a laala mmụọ ụnyahụ. Onye enyemaka pụrụichi Gọvanọ steeti ahụ bụ Mazi Ali Friday gwara BBC Igbo nke a. Ndị akpụobi achụsaala ndị gaara Oshiomhole ngagharịiwe Nke na-akpọtụ taa bụ na ndị akpụobi achuola ndị mere ngagharịiwe maka ichutu Adam Oshiomhole nke APC n'ọkwa ọsọ ụkwụeru ala. Mana ka akụkọ ka na-aga, ndị isi APC ekwuola na ha ga-ehibe kọmiti ga-ekpe udo, maka nsogbu niile ha na-enwegasị dịka odee akwụkwọ ha ziterela anyị. Abubakar Alihu bụ onye so na ndị were ya bụ ngaghịiwe sị na ụzọ ha chọrọ iji gosi iwe ha maka ọchịchị ya bụ onyeisi nke ha sị na ọ dịghị mma. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọbọgwụ emeriela n'ụlọikpe Ọbọgwụ ndị na-akpa ụrị na otu obodo akpọrọ Dax na mba Frans enwetela ikike ịme mkpọtụ dịka anụmanụ ha bụ ka ulọikpe gbajọrọ arịrịọ otu onye bi na obodo ahu rịọrọ ya. Ọ bụ n'ụbọchị Tusde ka ụlọikpe a kpebiri na mkpesa onye agbataobi ọbọgwụ ndị a na mkpọtụ ha na-enye ndụ ya nsogbu. Dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters siri kwuo, ọbọgwụ ndị a ruru iri isii bi na be otu nwoke aha ya bụ Dominique Douthe bi n'agada ugwu Pyrenees dị n'ime ime obodo na mba Frans. ""Ọbọgwụ emeriela,"" bụ ihe Douthe gwara ndị ntaakụkọ Reuthers ma gaa n'ihu kwuo na obi dị ya ezigbote ụtọ maka na ọ chọchị ""igbu ọbọgwụ ya."" Onye wegara mkpesa n'ụlọikpe bụ onye si obodo mepere emepe bịa biri n'ime obodo ahụ. Mkpesa bu ọzọ n'ime ọtụtụ mkpesa na-apụta ka ndị mmadu si obodo mepere emepe abịa ime obodo. N'ọnwa Sepụtemba, otu dịọkpa aha bu Maurice nwetere ikike n'ụlọikpe ịga n'ihu eti kokoroko ya dịka ọkụkọ ọ bụ. Ndị wegakwara mkpesa maka Maurice sikwa obodo mepere emepe bịa ime obodo akpọrọ Soustons. Akụnaụba Naịjirịa arịara n'ọkara ato nke 2019 ngalaba na-ahụ maka mgbakọ a kpọrọ National Bureau of Statistics, na-akọwa na akụnaụba Naịjirịa ji pacenti abụọ n'ọkara gbagote elu n'ime ọnwa atọ. Ihe a bụ mbụ akụnaụba Naịjirịa gbagotere karịa ihe ruru otu pacenti otu n'afọ 2019. Ọ bụ ọrịrị ego mmanụ agbịdị n'ahịa mba ụwa nyere aka na mbunyi akụnaụba a Evu agbagbuola mmadu atọ n'Indonesia N'ime izuụka abụo gara aga evu egbuola mmadụ atọ na mba Indonesia. Otu nwata akwụkwọ di afọ iri na otu nwụrụ na mpaghara West Java dịka ya na ndị enyi ya atọ gara itisa ụlọ ọvụvụ. Nke a na-abịa ka ndị agadị abụọ nwụrụ na Obodo Klaten, na mba ahụ. Ganduje akpọọla ekwe nkụ n'ikpe chuturu ndị Emir anọ o hiwere Gọọmentị steeti Kano sị na agbanyeghi nkụsa ụlọikpe kụsara ndị Emir anọ ha hiwere na ọ ga-aga n'ihu na-ahụta ha dịka ndị Emir. Gọvanọ Abdullahi Ganduje onye kwuru nke a site n'ọnụ komishọna mgbasaozi ya bụ Muhammad Garba sị na ha ka na-enyocha ikpe ahụ. Ndị obodo anọ nke ụlọikpe kachapụrụ oche eze ọdịnala ha gụnyere Bichi, Rano, Karaye na Gaya. Ọ sị na gọọmentị agaghị anọ chịkọta aka abụọ ka ụdịrị ikike a ọchịchị mebie ọ dị mma na mmepe nke steeti ya. Gọọmentị sị ka ndị mmadụ bi na Kano dere jụụ ruo mgbe ha ga-eme mkpebi ọhụrụ. Ndị uweojii agbawala ogbunigwe n'Anambra Uweojii Anambara sị na ha agbawala ogbunigwe eji lụọ agha Bịafra ndị na-arụ ụlọ gwuputere n'Ọka. Ọnu an-ekwuru uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed si na agbanyeghị na ogbunigwe a agbaghi mgbe a na-egwupute ya, ọ ka dị ezigbote ire. Aka m dị ọcha - Gracious David West I chetere akụkọ Nwokoroọbịa ahụ a sị na-egbu ụmụagbọghọ n'ụlọ ndịna na Portharcourt? Ọ kwa nke kwetere na aka ya dị n'ogbugbu ha? Eeeh! mana ọ pụtara n'ụlọikpe ụnyaahụ gọọ na ụkwụ na aka adịghị zi n'ọnwụ ụmụagbọghọ ahụ, sị ka ndị uweojii weta ihe akaebe. N'ofesi Praịm minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyanhu aṅụọla iyi i ji si ọchịchị ya ike n'agbanyeghi ebubo iri ngarị na mpụ e boro ya. N'egwuregwu Pochettino nọrọ afọ ise dịka onye nchịkọta/nkuzi Tottenham Mauricio Pochettino bụ onye Tottenham chụrụ achụ ekelela ndị otu ya n'ụzọ pụrụiche n'agbanyeghi na ọ hụghị ha tupu a chụọ ya. Dịka o si dee ya n'ihu bọọdụ, ọ sịrị ha 'unu emeela, anyị agahị asị ka ọ dị maka na unu ga-anọ m n'obi n'oge niile'. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-57182857,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57182857,Chief of Army Staff: Attahiru Ibrahim bụ onyeisi agha Naịjirịa anwụọla na ihe mberede ụgbọelu,Onyeisi ndị agha Naijiria bụ Ibrahim Attahiru anwụola dịka ụgbọelu ndị agha kpọkasịrị na nso ọdọ ụgbọelu Kaduna na mgbede Fraide.,"Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naijiria bụ Yerima Mohammed gwara BBC na ya bụ akụkọ bụ eziokwu. Attahiru na mmadụ asatọ ndị ọzọ nwụrụ na ya bụ ihe mberede. Attahiru were ọchịchị dịka onyeisi ndịagha n'aka Tukur Buratai n'ụbọchị 26 ọnwa Jenụwarị afọ 2021 bụ onye jibu ọkwa ahụ. A mabeghị ihe mere mana ndị Agha ugbọelu kwupụtara n'akara Twitter ha na ụgboleu ha nwere ihe mmerede, mana ha ha ekwughị ndị o metụtara. Ihe i kwesịrị ịma maka Attahiru Attahiru bụ onye Kaduna Steetị dị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa. Tupu o were ọchịchị ndịagha, ọ bụ onye ndu ndịagha ""82nd Infantry Division."" Ọ rụburu ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno State, a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole' ruo 2017. Ụgbọelu ndịagha Naịjirịa kpọkasịrị n’akụkụ ọdọụgbọelu Kaduna Steetị dịka ndịagha ụgbọelu si kwuo. Ụgbọelu ndịagha Naịjirịa kpọkasịrị n'akụkụ ọdọụgbọelu Kaduna Steetị dịka ndịagha ụgbọelu si kwuo. Ọnụ na-ekwuru ndịagha ụgbọelu bụ Edward Gabkwet kwuru nke na Twitter. A mabeghi ihe butere ihe mberede a ma ọ bụ mmadụ ole nwụrụ na ya. Akụkọ ka na-abịa" 52762882,https://www.bbc.com/igbo/52762882,Coronavirus cure: A rụpụtala ọgwụ mgbọrọọgwụ maka coronavirus na Naịjirịa?,Mịnịstrị na-ahụ maka sayensị na nka na ụzụ (Federal Ministry of Science and Technology-FMST) ekwuola na ha amaghị maka ọgwụ e mere maka ọgwụgwụ coronavirus nke e ji aha mịnịstrị ahụ mee.,"Ọgwụ mgbọrọgwụ ahụ nke foto ya gbara na soshal midia ụbọchị Tọzde, enweghị akara gosiri na o nwere nkwado nke NAFDAC. Mana o gosiri 'ginger','garlic' na mkpọrọọgwụ na mkpaakwụkwọ ndị ọzọ e jiri mee ya ma gosikwa na ọ bụ SHESTCO bụ ụlọọrụ nọ n'okpuru ministrị na-ahụ maka nka na ụzụ mere ya. Sheda Science and Technology Complex (SHESTCO) bụ ngalaba na-ahụ maka nchọcha na mmepe obodo. Ha nwere lab atọ; nke "" Biotechnology' nke' Chemistry' nakwa nke 'Physics Laboratory.' Mbọ BBC Igbo gbara inweta onyeisi ngalaba ahụ bụ Ọkammụta Paul Onyenekwe amịtaghị mkpụrụ dịka ekwentị ya agaghị aga mana ọnụ na-ekwuru mịnịstrị nka na ụzụ bụ Abdul Ganiyu Aminu kwuru na mịnịstrị ha amaghị maka ọgwụ ahụ. Aminu sị na ihe e nyere ngalaba nọga n'ọkpụrụ FMST bụ ikike ime 'facemask', kemical a na-efe maka aka mgbochi ọrịa nakwa nnyocha maka Covid-19. ""O nweghị mgbe anyị mere ọgwụ maka ọgwụgwọ coronavirus."" N'otu aka ahụ, ụlọọrụ NAFDAC kwuru na ha edebanyebeghị aha ọgwụ ọbụla na Naijiria maka ọgwụgwọ coronavirus. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50815409,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50815409,Sex Trafficking: Ụmụagbọghọ Afrịka a tọrọọ gaa ịgba akwụna na India,Ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị Afrịka nọ na mba India agba akwụna.,"Nchọpụta BBC 'Africa Eye' mere gosiri na ụmụnwaanyị ndị a akpachaghị anya na-eme nke a. E nwere otu ndị ekperima ndị aka ọrụ ha bụ ịghọgbu ụmụnwaanyị ka ha si Afrịka bịa India. Ha na-ekwe ụmụnwaanyị ndị a nkwa ọrụ dị iche iche ga-enye ha ego, mana otu abụghị n'ezi. Ọtụtụ ụmụagbọghọ ndị a bụ ndị mba Kenya, Uganda, Nigeria, Tanzania nakwa Rwanda. BBC 'Africa Eye' sooro otu onye n'ime ha aha ya bụ Grace wee gaa India ịchọpụta nke bụ eziokwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-50514449,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514449,Bleaching the skin: Ụzọ ọzọ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha,Nwanne ihe anya hụrụ gbasara ụzọ ọhụrụ ụmụnwaanyị si agbanwe ahụ ha ka ha chaa ọcha dịkwa egwu.,Nke a mere ka ndị mmadụ bido gosiwe mgbagọjụ anya ha maka atụmaatụ a ndị na-eme ya kwuru na ọ nọ ọnụ puku naịra iri atọ. Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị Lekwa ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @aquillox kwuru na nke a riri ya ọnụ. @Jason_Cryptoz kwuru na ahụ mara ya riri mgbe o kiriri atụmaatụ a n'onyonyo na-efegharịnu. @Amsantiedo kwuru na ndị a egbuo ndị a. @DohdohChichi kwuru na ọ bụ onye isi oji etu ahụ ya si acha na-amasị mere ihe a. Lee ụzọ ole na ole ndị mmadụ si eji ude acha ọcha Dkta Chidinma Gab-Okafor kpọpụtara ụzọ anọ a dịka etu ndị mmadụ si eji awụchapụ elu ahụ ha. Dkta Gab-Okafor kwuru na nne ji udiri icha ọcha ọbụla bụ ihe bekee kpọrọ Bleaching. I mana ite ude ga-acha gị ọcha nwereike ị na-agị ịmụ nwa? Ihe ndị a socha bụrụ ọghọm dị n'ịwụchapụ elu ahụ mmadụ. Akụkụ ahụ gị ịwụchapụ elu ahụ nwereike ịla n'iyi Akụkọ ndị ga-amasị gị Ọgba mbọ: Ihe mere m ji hapụ ọrụ ọkaiwu mewe ma rewe ọkpa afirika-50675411,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50675411,Igbo Greetings: Uru ekele bara n'ala Igbo,"Ndị Igbo tụrụ ilu sị na, 'Ekele na-eme ka ihu saa' dịka ọ bụ ụzọ mmadụ ji egosipụta etu obi dị ya n'ebe onye ọzọ nọ.","N'omenala Igbo, ekele bụ ihe mbụ na-ebute ụzọ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ma bụrụkwa ụzọ e ji egosi nkwanye ugwu. Ikele na ikwe ekele bụ ihe zuru ụwa niile ọnụ. Ma ndị isiọcha, ndị isiojii, ndị Awụsa, Yoruba na ndị Igbo na-ekele ekele. Mana akụkọ a na-eleba anya n'ekele dịka omenala na njirimara ndị Igbo. Kedụ etu ndị Igbo si ahụta ekele? Ekele so n'otu n'ime omenala ndị Igbo gbapụtara ihe nke mere na onye Igbo ọbụla na-akpụ ekele n'ọnụ mgbe niile. Ekele n'ala Igbo dịrị nwoke ma nwaanyị, nwata nakwa okenye mana ọ bụ nwata na-ebu ụzọ a tụpụ ekele. Ihe mbụ a na-akụziri nwata n'ala Igbo bụ etu o si ekele ekele karịsịa ndị tọrọ ya atọ na nzaghachị okenye ga e kelekwa ya. Ụdịrị na usoro ekele e nwere n'ala Igbo N'ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, nakwa ihe nke ọbụla na-egosipụta. Ụfọdụ n'ime ha gụnyere; Ekele njirimara ndị Igbo -Nke a bụ ekele e ji mara ndị Igbo, ha ji enwe mmekọrịta karịsịa ma ha nọkọrọ ọnụ n'ime ọgbakọ dị iche iche. I ji maa atụ bụ Chaa! Chaa!! Chaaa!!! Igbo kwenu! -Heee! Mụọnụ - Heee! Zụọnụ - Heee! Rienu! - Heee! Kachaanụ - Heee! Ekele oge ụbọchị - Ekele oge ụbọchị bụ ndị a na-ekele n'oge dị iche iche n'ụbọchị dịka n'ụtụtụ, n'ehihie nakwa n'abalị. Iji maa atụ, ""Ị bọọla chi?""; ""Ị pụtala ụra?""; ""Ụtụtụ ọma;"" ""Daalụ"" Ehihe ọma, Ụhuruchi ọma, Ị batala ọrụ nke taa? Ka chi fo, Rahụ jụụ dgz. Ekele ọrụ - Nke a bụ ekele ndị a na-ekele mgbe mmadụ na-arụ ọrụ, e nwekwara ike iji ya a gba mmadụ ume nke gụnyere Jisie ike, Ndewoo, Daalụ dgz. Ekele ọrụ na-adịkwa iche site mpaghara Igbo dị iche iche. Ndị mpaghara Enugwu na-ekwu , 'Dejee', ndị Bende n'Abịa steeti na-ekele, ""Jọkwa"", ebe ndị Ngwa na-ekele , ""Maazị"". Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya? Ndị Abakaliki na-ekele, ""Tọkwe ehụ"" (well done), ebe ndị Afikpo na-ekele ""Ị dị ike ọrụ,"" maọbụ ""Ka."" Ekele njem - Ekele a bụ nke ndị Igbo na-atụpụrụ onye na-eme njem dịka ""Ije ọma"", ""E jee a lọọ"", ""Ije awele"", ""ka ọ dị"", ""ka okporoụzọ rubere gị isi"" dgz. E nwekwara nke e ji a nabata onye si njem bata dịka ""Ị lọtala?"", ""Nnọọ"" dgz. Ekele nkasi obi - Ọ bụ ekele ndị Igbo ji akasi onye nwere otu ọdachi maọbụ nke ọzọ obi n'ihe dakwasịrị ya dịka ""Kara obi"", ""Diwe"", ""Ndo"", ""Gharawa"" dgz. Ekele nri - Nke gụnyere ekele a na-ekwe mgbe ndị Igbo na-eri nri maọbụ mgbe ha richara nri dịka; ""Bịa rie nri"", I meela, I sie, Daalụ na nri ụtọ a dgz. Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha ji egosipụta ekele na-abụghị site n'okwu ọnụ nke gụnyere Ikwekọrịta n'aka, Ife aka, ịkụkọta akupe ( ndị ichie), ibi ọma, itu mmadụ aha na ndị ọzọ. A bịa n'ime usoro ekele niile ndị a, ihe kachasị mkpa bụ iji nghọta, nsọpụrụ nakwa obi ọcha e ji kele ha. N'ihi na ọ bụ nke a ga-akọwa ebumnobi onye mmadụ nwere n'ebe ibe ya nọ n'agbayeghi mgbe ụfọdụ ""ụtọ abụghị n'ọchị eze"". Akụkọ dị ga-amsị gị:" afirika-49445478,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49445478,"Nnia Nwodo: Nnamdi Kanu, okwu ọjọọ na ịkọ ọnụ agaghị enye anyị Biafra",Onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ John Nnia Nwodo dere akwụkwọ ozi oha degara Nnamdi Kanu ma gwa ya na okwu ọjọọ na ịkọ ọnụ agaghị enye Igbo Biafra.,"Nke a na-abịa dịka Kanu na ndị otu ya bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) na-ama ndị ndu ala Igbo aka n'ihu. N'ime akwụkwọ ozi ahụ nke na-emetụ n'obi, Nwodo kwuru na ihe o ji dee ya bụ akwụkwọ ozi bụ iji kwuru ọnụ ya n'ebubo nile ndị Ipob na-ebokarị ya. Lee ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: 1. Aka m adịghị n' Egwu Eke (Operation Python Dance) nke ndịagha Naijiria mere n'ala Igbo n'afọ gara aga. Abụghị m onye agha nke m na-abụ onyeisi ndịagha. Mgbe ndịagha kwuru na ha ga-eme Egwu Eke nke abụọ, a katọrọ m ya. 2. Mgbe Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ ""Biafra Security Service"", e kwurum ka onye ọbụla kpachapụ anya. Mgbe gọọmentị etiti kpọrọ Ipob otu ndị oyi egwu, a katọrọ m ya nke ukwuu. 3. E degaara m onyeisi ọgbakọ mbaụwa bụ ""United Nations"" akwụkwọ ma kọwaara ya na Ipob na Massob abụghị ndị ọgbaaghara. Anaghị m akwado etu niile ndị Ipob si eme ihe mana onweghi mgbe ha ji buru egbe maọbụ mma iji yie ndị mmadụ egwu. Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-enye onye ọbụla ga-ekwuputa ebe ndị ndu ala Igbo ọbụla na-abịa mba ofesi ga-anọ, otu nde naịra 4. Ebuuru m okwu gbasara ndị Ipob gaa ""Chatham House"" na mba Briten ebe m kwuru na ndị Igbo bụ ndị kacha egosi na Naijiria bụ otu. Mana gọọmentị Naijiria ka na-eme anyị ka ndị mba ọzọ. 5. Ebubo Nnamdi Kanu boro m na m bụ onye na-arụrụ ndị Fulani ọrụ, enweghi isi. Ana m akatọ Onyeisiala Buhari, mana agaghị m akpọ ya iyi maọbụ kwuo na Naijiria bụ ụlọ ụmụanụmanụ. 6. Nna m rụụrụ Zik na Okpara ọrụ dịka mịnịsta. Nna m so na ndị kwadoro Biafra n'oge agha. Mụ na onwe m lụrụ agha Biafra oge m bụ okorobịa. 7. Mụ na Odumegwu Ojukwu dịka nwanne na nwanne. Alex Ekwueme bụ ezigbo enyi m. Nnamdi Azikiwe weere m dịka nwa. Michael Okpara bụ onyeisioche n'oriri agbamakwụkwọ m. Ndị na-akwado Ipob so onye ndu ha na-ama ndị ndu ndị Igbo aka n'ihu 8. Okwu ọjọọ, ịkpọ iyi nakwa okwu nwereike ibute ọgbaaghara, agaghị eme ka e nye anyị Biafra. E wepụ ịlụ agha, onweghi onye ga-amanye Naijiria n'ike ka e nye anyị Biafra. Nwayọọ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ. 9. Okwu gbasara nnwereonwe abụghị ihe taa na echi, Catalonia na Saharawi Arab Democratic Republic bụ ọmụmaatụ. Ka anyị nwere ya nwayọ, hapụ ọgbaaghara. 10. Ana m akwanyere Nnamdi Kanu ugwu maka na ọ bụ onye obi siri ike. Mana achọrọ m ka onye ọbụla katọọ ya ma o mee nke na-adabaghị adaba. Nwodo kwuru na ya agbagharala Kanu maka mkparị niile ya na ndị Ipob kparịrị ya, mana ọzọ emezịna. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha" afirika-48992591,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48992591,Obiagu Market Fire: Lee etu ọkụ siri gbapịa ahịa dị n'Obiagu n'Enugwu,"Nnukwu ọkụ malitere n'ụbọchị Satọde gara wee tapịasia ngwa ahịa nakwa ụlọ ahịa ndị mmadụ n'Obiagu, Enugwu.","Ụlọahịa mmadụ 68 lara n'iyi n'ahịa dị n'Obiagụ n'Enugwu Onyeisi ndị na-atụ mgbere na ya bụ ahịa bụ Maazị Emeka Nnajiofor sị na ọ bụ n'amali elekere otu nke abalị ka ọkụ a malitere ire. Ọ sị na ngwa ahịa ego ya dị nde kwa ndịi naira repịara na ihe mberede a. Maazị Nnajiofor sị na ọ bụ mmadụ 68 ka ọkụ a metụtara ụlọ ahịa ha. O kwukwara na amabeghi ihe kpatara ọkụ a. Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agaala ahịa ahụ ma tie ndị ọdachị a dakwasịrị aka n'obi. Nnajiofor kwuru na gọọmenti Enugwu nyere mmadụ 68 a ọkụ ahụ gbara ahịa ha puku narị naira na otu na otu. Ndubuisi Afor, Christopher Ogbodo, Ability Joshua, Chinwe Obasi na Maria Chukwu bụ ndị ọkụ gbara ahịa ha kwetara na ha nwetara puku narị naịra nke ha na-aka gọmenti ma yọzịa gọmentị ka ọrụgharịa ahịa ahụ ngwa ngwa dịka okwere ha na nkwa. Emeka Nnajiofor kwuru na ihe ha chere butere ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ na ọkụ Latrik enyere ya bụ ahịa karịrị nnukwu. Ọtụtụ ndị na atụtụ gbam gbam osisi refọrọ ọkụ bụ ndị nọzị na ya bụ ahịa atụtụkọ ngwongwo. Ọkụ ahu malitere n'ime abalị Gọọmentị Enugu nyere ndị ihe a metụtara ego eji tie ha aka n'obi Christopher Ogbodo, Onye ọzụ ahịa n'Amigbo Obiagụ Enugwu. Chinwe Obasi, Onye ọzụ ahịa n'Amigbo Obiagụ Enugwu. Emeka Nnajiofor, Onye isi ndị ahịa Amigbo Obiagu, Enugwu steeti. Ndi na-ekpeka gbam gbma nọ n'ahịa ahụ Ngwa ahịa ọtụtụ mamdu nara n'iyi n'ahịa" afirika-53403660,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53403660,Hushpuppi: Dubai o ji maka Hushpuppi kwụsị inye ụmụ Naịjirịa visa? Lee nke bụ eziokwu,Nke na-ewu n'ụtụtụ a bụ na ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na ọ dịka Ramon Abbas Igbalode e ji Hushpuppi mara ebuterela ha ọgbatauhie maka etu e si nwuchie ya n'ihi nrụrụaka ego n'ịntanet.,"Mana otu onye nwere ụlọọrụ ebe a na-enye ndị mmadụ 'visa' Dubai bụ Emeka Ochoro kwuru na akwụkwọ ahụ na-efegharịnụ n'elu soshal midia kwuru na ndị mba ahụ akwụsila inye ndị Naịjirịa 'visa' bụ ụgha. O kwuru na naanị 'visa' Dubai akụsitụrụ inye ụfọdụ ndị mba ọzọ nke Naịjirịa so na ya bụ visa nlegharị anya. O kwuru na ndị Dubai na-ahazi ọba ọzi ha gbasara ndị mbịambịa ka ha wee tinye ihe ha kpọrọ 'travel insurance' nke ga-abụzị iwu na onye ọbụla na-abata be ha ga-enweriri. Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia maka atụmaatụ a @Kofi_Seven tinyere akwụkwọ gosiri ihe niile a ga-ebido kwụsị imere ụmụ Naịjirịa na-aga maọbụ bi Dubai. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụrụ na Hushpuppi nọ na Naịjirịa na a gaarala ahapụ ya ka ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ. BBC Igbo gara n'ọba ozi ndị Dubai ka ha mara ma akwụkwọ ahụ na-efegharị n'elu soshal midia adị ebe ahụ, mana ha ahụghị ya. Anyị ka na-agbalị ịnụta n'ọnụ ụlọọrụ na-enye visa maka ịga Dubai ka anyị mara ma ihe ụmụ Naịjiria na-efesa n'elu soshal midia a bụ eziokwu. Cheta na a sị na Hushpuppi na ndị otu ya zuru ego ruru nde dọla 14.7 ($14.7m) site n'aka otu ụlọakụ n'afọ 2019. Etu esi nwuchie Hushpuppi na Dubai Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ Ramon Abbas Igbalode e ji Hushpuppi mara dịka ọkaiwu ya pụtara n'ụlọikpe rịọ ka atọhapụla n'ụlọmkpọrọ ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe. Ọkaipke Jeffrey Gilbert bụ lere usoro ikpe a n'onyonyo na Chicago jụrụ ịtọhapụ Hushpuppi maka na o nwereike iripu ọsọ. Ọkaikpe a nyere iwu sị ka a kpọchie ya na mkpọrọ ruo mgbe a ga-eleba anya n'ikpe na Kalifonia na ngwụcha afọ a. Ọkaiwu Hushpuppi bụ Gal Pissetzky degara ụlọikpe akwụkwọ ka a tọhapụ Hushpuppi bụ onye e boro ebubo izu ohi n'ịntanet. Ụlọikpe a jụwara isi ma sị na a tọhapụ ya na o nwereike ịgba ọsọ maọbụ were ịntanet gwuo jangum ọzọ Mana e mechara nwụchie ya n'ọnwa Juun na Dubaị ma buru ya bata mba Amerịka ebe a na-ekpe ya ikpe ugbua. Goodluck Jonathan abụrụla onye nnọchiteanya Ecowas na mba Mali Otu jịkọrọ mba ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas ahọpụtala aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan dịka onye nnọchite anya otu ahụ na mba Mali. Ikechukwu Eze, onye enyemaka mgbasa ozi Jonathan, kwuru na ọrụ ya ga-abụ inye aka na mkparịtaụka iji mezie esemokwu dapụtara na mba ahụ. Jonathan ga-ahapụ Naịjirịa gawa mba Mali n'ụbọchị Wenezde. Ọgbaaghara dị na mba Mali ugbua nke malitere kamgbe ọnwa Maachị afọ 2020 oge e mechara ntuliaka maka ndị ụlọ omeiwu mba ahụ. Ndị oyi egwu na-enyekwa nsogbu na mba ahụ nke ukwuu. Ụlọomeiwu emeela iwu ka a malite ịtụ ndị ntọrị nga mkpụrụ ọka Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa nọrọ n'ụbọchị Tuzde mee iwu sị ka a tụọ onye ọbụla ikpe mara maka ịtọrọ mmadụ nga mkpụrụ ọka. Iwu ọhụrụ megidere ma nọchie anya iwu dị na mbụ sịrị ka a tụọ ndị dị etu a mkpọrọ afọ iri. Ọ hazigharịkwara iwu dịbu adị a kpọrọ 'Criminal Code' nke dị ire n'ọtụtụ steetị dị n'ọdịda anyanwụ ewepu Legọs. Ha gara n'ihu welite oge e tinyere n'inyete ikpe ziri ezi nye onye a wakporo n'ikeke site n'ọnwa abụọ ọ bụ na mbụ ruo afọ ole ọbụla ọ ga-ewe ụlọikpe inwete ikpe ziri ezi a. Onye kwadoro iwu a gaferela mkpọpụta nke n'ụlọomeiwu bụ Sịnetọ Oluremi Tinubu. Ọ bụrụ na ọ dị ire, agaghị enwe mmechi oge maka ime mkpesa onye a wakporo. Ihe ụwa agaghị echezọ maka nwaanyị na-eme ihe nkiri achọtara ozu ya na mmiri Obi gbawara ụmụ ụwa ka ndị uweojii kwuputechara na ha ahụla ozu Naya Rivera na-eme ihe nkiri n'Amerịka . Cheta na e bidoro chọwa ozu Rivera kamgbe ọ gara njem mmiri na California n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julai. Mana ndị ọrụ ha bụ ịba n'ime ala mmiri chọgidere ya ma chọta ozu ya na mmiri. A hụrụ nwa ya ebe ọ na-arahụ ụra n'elu ụgbọmmiri mana ahụghị Rivera. Lee ihe ndị a ga-eji cheta nwaanyị a Ndị mmadụ gosiri nwute ha n'elu soshal midia. Ndị otu ya na-ebe sọ akwa. Ndị mmadụ si ka echeta Rivera maka etu o si gbaa mbọ zọta ndụ nwa ya tupu ọ nwụọ. EFCC anwụchiela Onwuzurike Kingsley maka nrụrụaka ruru $8.5M Ngalaba Economic and Financial Crimes Commission n'ụbọchi iri na atọ bụ Monde ebidola ikpe maka ebubo nrụrụaka eboro Onwuzurike Ikenna Kingsley bụ onye si obodo Umurokoala nke Abia steeti. Ọ bụ okaikpe bụ A.T Mohammed na-ekpe ya bụ ikpe n'ụlọikpe elu nke dị na Port Harcourt, Rivers state. Ọ bụ n'ikpe a ka ndị EFCC kpọpụtara onye aka ebe ha bụ Abbas Suleiman bụ 'Assistant Detective Superintendent' nke ndị EFCC. Ebe a ka ha nọ kọwaa na ha napụtara Onwuzurike ekwe ntị, igwe kọpụta, akwịụkwọ ikike njem Naijirịa atọ na otu ụgbọala Acura. Eboro Onwuzurike ebubo iji ahụghọ napụ ndị mmadụ ihe ruru nde dọlla asatọ na ụma. Ebubo a kwuru na Onwuzurike mere ka ọ bụ ya bụ Jeff Sikora, onyeisi ụlọọrụ Prime Trust Credit Union Bank nke mba Amerịka were napụ ndị mmadụ ego nke gụnyere nwoke mba Ijipt ọ napụrụ nde dọlla isii na ụma. Ndị EFCC boro Onwuzurike ebubo na ọ natara dolla puku abụọ n'aka onye otu ya bụ Obi Taxas a na-achọ achọ nke bụ oke ya na nrụrụaka ha ji napụ ndị mmadụ ego. Dịka ọ dị ugbu a, okaikpe ebugharịala ikpe Onwuzurike ruo ụbọchị iri na isii na iri na asaa nke ọnwa Julị afọ 2020. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" media-47039461,https://www.bbc.com/igbo/media-47039461,Onnoghen: Sineti sị gọọmenti kpọchite ọnyeisi ndị omeiwu,"N'aka ọzọ, ụlọomeiwu Sineti akpọpụla gọọmenti etiti ụlọikpe ka ha were ọsọ were ije kpọchite Onnoghen bụ onye bụbụ onyeisi ndị okaikpe na Naịjirịa.","Sineti sị gọọmenti kpọchita Onnoghen Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye-kwuo-uche-ya Nke a mere ka ndị ụlọomeiwu mechichara ọgbakọ ha ụbọchị Tuesday. Ipob etinyela referendum Ode akwụkwọ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Onye ndu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ụbọchị iri na isii onwa Februwarị dịka ụbọchị ha ga eme referendum ịmata ka ndị mmadụ a ka chọrọ ị nọ na Naịjịrịa. Cheta na otu ụbọchị ahụ ka gọọmenti Naịjirịa nwere ntụliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu. US na UK akọwala ihe ha ji tinye ọnụ na okwu Onnoghen Ọkọrọtọ US na UK Onyeisi ụlọọrụ British kọmishọna dị na Naịjirịa bụ Catriona Liang ekwuola na ihe mere ha jị arịọ ka Naịjiịrịa kpe udo n'ihe gbasara nwepụ onye ọkaikpe ukwu Onnoghen, bụ maka na ha chọrọ ka udo chịa na ntuliaka 2019. N'otu aka ahụ Stuart Symington bụ onye nọchite anya mba Amerika na Naịjirịa sị na ihe mba ahụ ji tinye ọnụ na ya bụ okwu bụ maka etu ọ ga-esi metụta nwulite ọchịchị ọhakarasị na Naịjirịa. US akpụpụla ụlọọrụ Huawei ụlọikpe Akara njirimara Huawei N'ofesi, mba US agbaala ụlọọrụ Huawei na onyeisi ha okwu ego dị n'aka bụ Meng Wanzhou akwụkwọ maka ebubo ohi ego, ịgbọchị ikpe nkwumọtọ naohi ọrụaka ndị mba US. Ejidere Meng na Canada n'ọnwa gara aga ebe atụrụ anya na okwu a nwere ike ịkpali esem okwu dị na etiti China na mba US. Gee nkeji anyi ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri ebe a Onnoghen: Ihe ndị nwere agba na-ekwu maka ya Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43068435,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43068435,Ramaphosa bụ osote Zuma na-akawado ịbụ onyeisiala South Africa,"N'ozi o ziri nke a gbasara n'onyonyo televishon, Zuma kwuru na ya na-arịtu ozigbo.","Zuma(akaekpe) apụola, Ramaphosa(akanri) nọchie E boro Zuma, onye banyere ọchịchị kemgbe afọ 2009, ọtụtụ ebubo mmerụaka. Akwụkwọ ozi si n'aka ụlọọrụ gọọmenti kwuru n'ụlọ ọmeiwu ga-aahọ onye isiala ọhụrụ n'ehihie tọọsde. Onye bụ Cyril Ramaphosa Dịka ọnye ntaakụkọ BBC Milton Nkosi sịrị, ọtụtụ na-enwe olileanya na Ramaphosa ga-ewghachị akunaụba South Africa dịka mba ka mecharịcha emepe n' Africa, ebe ahụ Zuma na-eme ụfọdụ nihi na-o mere iwu ịkwụ oke ụgwọ akwụkwọ. Zuma, onye bụbu onye otu agha ANC n'oge ịkpaoke agbụ rịrị n'okwa were bụrụ onyeisiala. O duru obodo ahụ ihe karịrị otu n'ime ụzọ atọ oge kemgbe ha jiri pụta n'ikpaoke agbụ." afirika-50583998,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50583998,Gas Explosion: Anwụrụ agbagbuola ụmụaka abụọ n'Ajegunle,"Na Legọs, gaasị gbara n'ụlọọrụ a na-ere gaasị egbuola ụmụaka abụọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na atọ ahụ na Ajengunle Legos, dịka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo.","Ha kwukwara na a gbachiela gburgburu ahụ ịji malite nnyocha banyere ihe butere ya bụ ihe gbaranụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga Equatorial Guinea End of Twitter post, 1 N' aka nke ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem ọrụ na mba Equatorial Guinea echi. Buhari na-aga ebe ahụ ịnọchị anya Naịjirịa na nzụkọ mba ndị na-ebupu Gaasị mba ndị ọzọ. N'ofesi Mba Gana enyela ihe ruru mmadụ otu narị na iri abụọ bụ ndị mbịarambịara biri ọtụtụ afọ ikike ịbụ ndi ala ahụ. Onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo gwara ndị ahụ ha gbaa mbọ hụ na ha emeghị ihe ga-ebutere mba ọhụrụ ha ajọ aha. N'egwuregwu, William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti. Ọkwa Naịjirịa arịala ogogo anọ na ndekọ egwuregwu boolu nke FIFA mere na mba ụwa niile n'ọnwa Novemba Nke a pụtara na Super Eagles nọzi n'ọkwa iri atọ na otu n'ụwa nakwa ọkwa atọ n'Afrịka. Akụkọ ụwa n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Super Eagles: 'Ọnweghị ihe obiụtọ dị n'ọrụaka Gernot Rohr' - Fashanu Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Onye bụbu otu n'ime ndị isi na Football Federation Board nke Niajirịa bụ John Fashanu sị na onweghị ihe na-eme ya obi ụtọ na ọrụ Gernot Rohr. Anyị nụrụ na ọ si na Rohr enweghị ike ịzụpụta ndị egwu bọọlụ ga abụ ọkaibe na mba Afrịka. APC Edo ka nọ n'ihu ọkụ Ihe na-ebe ka na-ebe na APC Edo state ka ha jụrụ na ha agaghị aga ọgbakọ ndị ngalaba nke Ọdịda anyanwụ pati ha kpọrọ. N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ. Ortom emeriela an Benue N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ. Gọvanọ Benue steeti bụ Smuel Ortom amaliela elu ka ụlọikpe mgbegharị sị ya chiri gawa. N'ikpe ha kpebiri ụbọchị Tọzde, ha bụ ụlọikpe wezugara akwụkwọ onye APC bụ Emmanuel Jime gbara ị sị na ya ekweghị na mmerị Inec nyere Ortom. Onyeisiala Benin Republic sị EU puo n'ala ha Onyeisiala Benin Republic bú Patrice Talon Gọmenti mba Benin enyela onyenọchịta anya EU na mba ahụ ụbọchị mbu n'ọnwa Disemba ka ọkwara lii n'mba ahụ. Ha sị na Ambassador Oliver Nette na-etinye ọnụ n'okwu agbasaghị ya bụ nke nwere ike ịbute ọgbaaghara na be ha. Ụmụnwoke 47 agọrọla ụkwụ na aka ha n'ebubo banyere mmekọ ahụ nwoke na nwoke nke bụ agwa megidere iwu Naịjirịa. Iwu Naịjirịa kwuru na onye ikpe mara maka ihe a ga-aga mkpọrọ afọ 14. Ụmụnwoke ndị pụtara n'ụlọikpe dị na Legọs ụbọchị Wenesde bụ nke 28 n'ọnwa Nọvemba so n'ime 57 ndị uweojii nwụchiri n'afọ 2018 n'obodo Egbede dị na Legọs. Ndị uweojii sị na a na-eche ndị iyi ọnụ maka ịba n'otu ""ụmụnwoke na-edina ibe ya"", mana ndị a eboro ebubo sị na ọ bụ emume ncheta ọmụmụ mmadụ ka ha gara. Ikpe bụ nke a ga-eji nwaa iwu megidere alụmndị maọbụ mmekọ nwoke na nwoke ehibere mgbe Goodluck Jonathan na-achị Naịjirịa n'afọ 2014. Nhibe iwu a butere Jonathan ajọ aha n'etiti ndị na-achị mba ụwa ọkachasị David Cameron nke mba Briten. Onwebeghi onye a mara ikpe site n'iwu a, mana ụfọdụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye dịka ""Human Rights Watch"" sị na-eji ya amaja ndị mmadụ ma nara ha ego n'ike. Ndị na-ekpe ndị a ikpe gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ha ga-achọ ịkpụta mmadụ iri ndị ọzọ so n'ime mmadụ 57 amara ikpe ka ha bịa soro zaara ọnụ ha. Ikpe ndị a ga-amalitekwa n'ụbọchị 11 nke ọnwa Decemba. Ndị Customs mba ọdịda anyanwu zukọrọ maka bọda Ndị isiọrụ Customs Ọdịda anyanwu mba Afrịka e nweela nzụkọ N'Abuja ụbọchị Tuzde maka okeala Naịjirịa e mechiri ọnwa atọ gara aga. Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed na-akọwa na ha ekwekọrịtabeghị ịmeghe ya maka na mba ọdịda anyanwụ ndị ọzọ anaghị edowe iwu ụtụisi ha. Najirịa na-esi ọnwụ ịlawa utuisi n'elu ngwaahịa ọbụla na abata be ha. Okpunnabụenyi, peteri na ihe ndị ọzọ a na-atụbata Naijirịa na-emepụta Ndịisi Customs mba atọ a bidebere onwe ha zukọtara itinye ọnụ na ya bụ okwu bụ nke Naịjirịa sị na ọ na ebutere ha njọ ahịa. Cheta n'ọnwa July, Naịjriịa tinyere aka na akwụkwọ maka nkwado azụmahịa n'etiti mba atọ a bụ agbata obi. Mana Naịjrịa n-atụ egwu na ndị ejizi be ha mere ikpoahịhịa ebe ngwongwo sị mba ndị ọzọ na enubata na be ha maghara ịtụ ụtụisi, ma na-akụkwara ndị ọrụaka Naịjriịa ọrụ. Naịjrịa sị na ha ga-emechi okeala a ruo ọnwa Jenuwarị, ebe ha ritagoro uru ruru pasenti iri atọ maka mmanụ fuel ndị mmadụ na-ezupu, dịka Lai Mohammed kwuru. Nigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka Trump etinyela aka n'akwụkwọ maka Hong Kong Ka anyi ga na mba mba Amerịka ebe Onyeisiala Donald Trump tinyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka mba Amerika na-etinye anya na ikike diiri onye na Hong Kong. Ebe ndị ọchịchị China na Hong Kong na-akatọ ya bụ iwu, ndị na-azọ mnwereonwe na Hong Kong sị ọ magburu onwe ya. Liverpool a na-agba ọnyụpaa? N'egwuregwu, Liverpool bụ ndị bu iko Champions League nke afọ gara aga ka na-akpụakpụ na sizin a site na otu ọkpụ onye nawa onye nawa ha na ndị Napoli gbara onwe ha ụnyaahụ. Nke mere na Liverpool abanyenwughị gba nke ebe otu egwu boolu iri na isi ga-achipụ ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-54352101,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54352101,"Independence Day Nigeria: Ọ fọrọ obere ka Jonathan, Yar’Adua na Obasanjo mebicha Naijiria - Buhari",Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọnọdụ Naijiria nọ ugbua bụ gọọmenti chịrị bido n'afọ 1999 rue 2015 oge ọ banyere ọchịchị tinyere Naijiria na ya.,"Buhari kwuru nke a ụbọchị Tọzde n'ozi ọ gbasara n'ikuku dịka Naịjiria na-eme ncheta afọ 60 e nwetara Nnwereonwe n'aka mba Briten. ""Ndị chịrị ọchịchị bido na 1999 rue 2015 bụ ndị mebichara Naijiria bụ ndị nweziri ọnụ ha jị akatọ mbọ anyị na-eme."" Jonathan chịrị Naijiria bido n'afọ 2010 rue 2015 oge ọ hanyere ọchịchị n'aka Buhari. Musa Yar'Adua chịrị afọ 2007 rue 2010, ebe Olusegun Obasanjo chịrị bido 1999 rue 2007. O kwuru na o nweghị gọọmenti gara aga merela ihe ọchịchị ya ji nwa obere ego nọ n'akpa mee. N'okwu mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke o kwuru na a ga-ebido rewe otu nari naira na iri isii na otu (N161), Buhari kwuru n'ọnụ mmanụ ka dị elu n'ụfọdụ mba dị n'Afrịka dịka Gana, Niger na Chad. Ihe ndị mmadụ kwuru Ndị Naịjirịa asaala Onyeisiala Muhammadu Buhari n'okwu o kwuru ebe ọ sị na ego mmanụ agbịdị ekwesighị ịka dị ọnụ na mba Saudi Arebia karịa na Naịjirịa. Ndị mmadụ kwuru sị na o kwesịrị ịkwụlite ndị mmadụ ụgwọ tupu ọ tụnyewe ego ole a na-ere mmanụ agbịdị na Naịjirịa na mba ndị ọzọ ahụ ọ kpọrọ aha. Nicholas Ibekwe kwuru sị na Naịjiria na-akwụ naanị pasentị iri n'ime ụgwọ opekatampe ndị Saudi Arebia na-akwụ ndị mba ha. Bulama Bukarti tụnyere ego ole Naịjirịa na-akwụ n'ụgwọ opekatamba na nke Saudi Arebia na-akwụ ma kwuo na ọ bụrụ na Buhari malite ịkwụ ndị Naịjirịa ihe a na-akwụ na mba ahụ, na ndị Naịjiria ga-amalite ịkwụ ego ole ndị Saudi Arebia na-akwụ maka mmanụ ụgbọala. Sodiq Alabi jụrụ sị ""ego ole bụ ụgwọ opekatampe na mba ndị a?"" Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ Buhari kwuru Ọ malitere sị na ọ dị mkpa itule uche banyere etu Naịjiria si rute ebe ọ nọ ugbua, nke ga-eme ka mba a nwee ike ijikọ aka ọnụ wee toruo ebe ndị bi na ya na-atụ anya itoru dịka mba siri ike na-enweghi ihe pụrụ ikweli ya, ma bụrụ ebe olileanya na otu ohere ruru ma onye ukwu ma onye nta ga-ejikọ mba a. 1. Ihe gbasara ọnụ ego a na-ere mmanụ agbịdị Buhari sị na n'ihi etu ihe siri dị mere e ji metụ aka n'ihe gbasara ego ole a ga na-ere mmanụ agbịdị. O ji mba ndị dị ka Gana, Niger na Chad maa atụ maka etu Naịjirịa si ere na etu ndị agbataobi Naịjirịa na-emepụtakwa mmanụ agbịdị si ere nke ha. Ọ gara n'ihu kwuo na ego mmanụ agbịdị ekwesighị ịka dị ọnụ na mba Saudi Arebia karịa na Naịjirịa. Buhari kwukwara na Naịjirịa ji mkpebi itinye uche na nrụgharị, inye aka nakwa ikpezi pụta agha Naịjirịa na Biafra. Mkpebi a nyere aka nye anyị mepee obodo pụrụiche ma hazie ọrụ gọọmentị iji nyere gọọmentị aka. O kwuru na mgbe Naịjirịa natachara nnwereonwe, na Naịjirịa malitere ito na-abawanye site n'atụmatụ na iwu ndị e wepụtara nke metụtara mpaghara dị iche iche n'akụnaụba obodo. Mana ọ sị na agha Naịjirịa na Biafra bere ya bụ atụmatụ ọdụdụ. 2. Naịjirịa mere ọfụma ma banye ọchịchị ndị nkịtị tupu ndị agha abịa ghasaa ya. Buhari sị na ndị agha chịri Naịjirịa ruo afọ 29 n'ime afọ 60. Buhari kwuru na Naịjirịa malitere ịga ọfụma dika alụchara afgha Naịjirịa na Biafra tupui ndị agha abịa nara ọchịchị ọzọ. 3. Nsogbu Naịjirịa si n'ịkpa oke aghara aghara Buhari sị na ọkankụ nsogbu Naịjirịa na-enwe sitere n'oke agbụrụ ezigbiezi ndị mmadụ na-arụrụ aka kwa mgbe. Buhari sị na ọrụ gọọmentị, uweojii, ụlọikpe, ndị agha lara azụ ọfụma na Naịjirịa. Ọ sịkwa na ndị mmadụ na-ahụ onwe ha dịka ndị si mpaghara dị iche iche tupu ha ahụ onwe ha ka ndị Naịjirịa bụ ihe mbụ a ga-etinye uche na ya tupu a gawa n'ihu imezi Naịjiria. Ọ sị na ndị Naịjirịa na-agba mbọ ebe niile nke bụ ezigbote ụzọ a ga-esi hazie nsogbu a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45281028,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45281028,Ndụmọdụ 11 dị oke mkpa maka ndị chọrọ ịga ala bekee ga biri,BBC Igbo dere akụkụ maka ndị chọrọ ị ga-ala bekee (Canada).,"Okporo ụzọ n'ala Britain Anyị siri ka ndị chọrọ ị ga mba ahụ welie aka elụ. Ọtụtụ mmadụ welikwara aka elu ị gosi mmasị ha ị ga mba ahụ. Anyị bidokwara ị gba ndị ọkachamara ajụjụ ọnụ ịmata ihe dị na njem ka anyị were waa ndị na-akwado ịpụnjem anya. Akụkọ maka ndị chọrọ ịga ala bekee Nwafo Igbo, Paul Nwachukwu bụ nke bidogoro mba Saụt Afrika afo iri na itooli wara Igbo anya maka ihe ndị chọrọ ịpụ njem ga ebu n'obi. Nwachukwu kwuru na ọbụghị ihe akịinu na-ada bụ ka ọ na-atọ na-ụtọ. Ọmara atụ sị na n'ime mmadụ iri bụ ndị Nịajirịa pụrụ njem, na mmadụ anọ maọbụ ise na-atọ n'ije. Lee ihe ọgwara anyị mere ha jị ato n'ụzọ. Okporo ụzọ n'ala Britain Maka ndị chọrọ ị ga-ala bekee, lekwa azụ ụnụ Onyeọkaiwu anyị, Chukwuemeka Eze bụ onye na nkuzi ndị mahadum tinyekwere ihe ndị a na ya bụ okwu. Ọtụtụ ndị Igbo biri na NewYork Ndị mmadụ na-aga njem maka na ha chọrọ ị zụ ahịa dị iche iche Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44271448,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44271448,Lai Mohammed: Buhari emeela ọfụma n'ime afọ atọ,"Lai Mohammed kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, emezuola nkwa niile o kwere mgbe ọ na-abata ọkwa ọchịchị.","Lai Mohammed na-ekwu na ndị nkatọ bụ ndị ụgha makana onyeisiala anwaala. O kwuru na Buhari emekarịala ka a tụrụanya n'afọ atọ ọ chịrịla. Mohammed kwuru na ebe onyeisiala gbadoro ukwu n'imezu nkwa ya bụ n'ibuso mpụ agha, imelite akụnaụba obodo nakwa iweta ezi nchekwa. O kwuru na kamgbe afọ garalanụ Naịjirịa na-ebilite site n'ihe ọjọọ niile ọ gabigara dịka mmeruaka, ajọ ọchịchị nakwa mgbatu ego mmanụ agbidị. Ihe ndị ọzọ Lai Mohammed kwuru maka afọ atọ onyeisiala chigoro n'ichafu 1. Ọkụ Latrik: Ọchịchị Buhari buliri mmepụta ọkụ latrik site na 2,690 mega watts ruo na 7,000. 2. Mmepụta osikapa: Naịjirịa jizi aka ya emeputa osikapa nke bụ na tupu afọ abụọ agafechaa, o nwekwara ike ị na-emepụta osikapa ruru metric 'tonnes' nde isii ka ọ wee zuo Naịjirịa niile. 3. Nri umụakwụkwọ: Ọchịchị Buhari na-enye ụmụakwụkwọ ruru nde asatọ na puku narị abụọ (8.2million) nri n'ụlọakwụkwọ karịrị puku 45 ma nyekwa ndị osi nri karịrị puku 87 ọrụ. 4. Ụgwọọnwa ogbenye: Ọ sị na ọchịchị Buhari na-akwụ ndị ogbenye karịrị puku narị abụọ na iri itoolu na asaa (297,000) ụgwọ puku naịra ise (N5000) kwa ọnwa. 5.Akụrụngwa: O kwuru na ọchịchị Buhari agbanweela akụrụngwa Naịjirịa site n'itinye ego ruru tarịị abụọ na ijeri narị asaa (2.7trillion) na ya. 6.N-power programme: Emume a enyerala mmadụ ruru nde itoolu aka. 7.Nchekwa: Ọchịchị Buhari achụọla Boko Haram mbombo ọsọ. 8.Akụnaụba: Ihe ịda ọnụ agbatuola kamgbe ọnwa 15 ka na-aga, ọkwụkwụ ụtụisi arigotela. Ọchịchị wepụtara usoro a ga-eji hazie akụnaụba Naịjirịa ruo afọ anọ (2017-2020) Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45393827,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45393827,Ndị ọrụ nchekwa sị ka a gba Ipob nkịtị maka okwu 'sit-at-home',Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa gwara ndị bi na mpaghara ahụ ka ha ghara ige otu n'ime otu chọrọ ka e kewaa Naịjirịa bụ nke Bekee Kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) ntị.,"Ụzọ Faulks dị n'Aba mgbe e mere ncheta Biafra Okwu a pụtara na nzụkọ ndị isi uweojii, ndịagha, ndị DSS nakwa ndị Civil Defence mere n'Akwa, isi obodo Anambara steeti n'ubọchị nke atọ n'ọnwa Septemba, 2018. Onyeisi ndị uweojii n'Anambara bụ Garba Umar, kwuru na Ipob bụ otu iwu machiri, nke mere ha ejighi nwee ikike inye onye ọbụla iwu. Umar sị: ""Iwu machiri Ipob. Ya mere anyị ji arịọ ọha ka ha ghara ịtụ ụjọ maọbụ kwe ma a kwanye ha ige ndị Ipob ntị. Ha na-akwado ime ka ndị mmadụ ghara ịpụta n'ụbọchị iri na anọ nke Septemba, mana ndị nchekwa dị njikere. ""Anyị na-ekwusi ike ka ndị mmadụ gaa ebe ọbụla ha chọrọ ịga makana anyị ga-ahụ na anyị chekwara ha. Anyị dị nkwadobe maka ihe ọbụla ga-eme."" Cheta na Ipob kpọburu oku ka ndị mmadụ ghara ịga ọrụ maọbụ ahịa n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee maka ncheta Biafra. N'agbanyeghi na ndị nchekwa gwara ọha ka ha ghara ige ntị, ndị mmadu na ụfọdụ obodo n'ọwụwa-anyanwụ gbachiri nkịtị nọrọ n'ụlọ ha ụbọchị ahụ. Ọgbaghara dara n'etiti ndị Ipob na ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị 14 nke Septemba n'afọ gara aga butere mmachi Ipob, na itinye aha ha ka otu na-eyi egwu na Naịjirịa. Mana ọ bụ naanị Naịjirịa kwenyere na mkpebi a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49055706,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49055706,Timi Dakolo: Ana m atụ egwu ndụ m,Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naịjirịa dere na Twitter sị ka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa tinye anya n'oku ndị otu ya kpọrọ Timi na Busola Dakolo.,"End of Twitter post, 1 Ndị uweojii na onwe ha kọwara ihe mere ha ji wụchie n'ihu ụlọ Timi n'ụbọchị Satọde, Julaị 20, 2019. Ha dere n'elu Twitter sị na ha gara inye ya na nwunye ya akwụkwọ ozi ha ga-eji bịa za oku a na-akpọ ha n'ụlọorụ ha. Ha kwuru na ihe mere e ji akpọ ha ya bụ oku abụghị ka anwụchie ha, kama na ọ bụ ka ha bịa kwuru ọnụ ha maka ebubo mwakpo n'ike ha na-ebo ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo n'ime nyocha ndị uweojii na-eme. Nke a na-abịa ka Timi dere n'elu Instagram ya etu ndị ọ na-amaghị bu egbe na ụgbọala si wụchie ụlọ ya ma gbochie ezinaụlọ ya. O mechara kwuo etu ndị ọkaiwu ya si sị ya kwado maka ụbọchị dị etu a: Alex Iwobi agọrọla isi onwe ya Iwobi malitere egwubọọlụ n'ụlọọzụzụ ndị Arsenal mgbe ọ dị afọ itoolu n'afọ 2015 N'egwuruegwu nwa afọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi ekwuola na ọ nweghị mgbe ya ji kwuo na ya ga-ahapụ Arsenal ma ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ ha gote Wilfried Zaha nke Crystal Palace. Iwobi sị na nke ahụ bụ akaọrụ ndi amụmụ ụgha. Ndị omekome emekwa ọzọ n'Enugwu steeti Rev. Fr. Ikechukwu Ilo bụ onye isi nchụaja na St. Patrick Parish, Nome Ka anyị bido n'Enugu steeti ebe ndị omekome wakporo Rev. Fada Ikechukwu Ilo n'Nume dị n'okpuruọchịchị Nkanu East ụbọchị tọzde. Fada Ikechukwu bụ onye nọ na Annociation Hospital, Emene anata ọgwụgwọ ụgbụa sị na obi dị ya ịnụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulani na-achi ehi wakporo ha. Gọọmentị Zamfara azọpụtala mmadu 15 n'aka ndị ntọrị Ndị omekome na akpa nkpankpa na Zamfara Gọọmentị Zamfara steeti azọpụtala mmadu iri na ise bụ ndị ndị ntọrị tọrọ onwa atọ gara aga. Ndị a zọpụtara gwara BBC na ndị ntọrị a biara n'ụlo ha ma na ugbo ha were tọro ha. Dịka nkea n'eme ka igwemmadụ bu ozu mee ngagharịiwe n' obi gọmentị ha na Gusau bụ isi obodo ha. Igwemmadụ a sị Kaura-Namoda tigaara gọọmenti mkpụ, na ike agwụla ha maka ogbugbu ndị omekome na-egbu ndị be ha agbanyeghị akwụkwọ udo ha na ha binyere aka. Philip Hammond ""arụkwaghịm ma Bori Johnson bụrụ onyeisiocheBriten"" Phillip Hammond Phillip Hammond ekwuola na ya ga-agba arụkwaghị m ọ bụrụ na Boris Johnson mechaa were ọnọdụ dịka onyeisiọchịchị mba Briten. Iwe Hammond bụ na ọ sị na Johnson enweghị ihe o kwuru ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ha na European Union enweghị nkwekọrịta na ọpụpụ Briten chọrọ ịpụ na EU. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Buhari etiela ndị Sokoto aka n'obi maka ọnwụ mmadụ 37 Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ ndị ihe metụttara na Sokoto aka n'obi. Buhari kwara arịrị maka etu ndị omekome si wakpoo okpuruobodo Goronyo dị na Sokoto ma gbuo ihe ruru mmadụ iri atọ. O kwukwara na ọ ga-agba mbọ hụ na e wepụtara usoro nchekwa ga-arụ ọrụ ma kwụsị oke ogbugbu. O kwuru nke a ka ọ na-akatọ ogbugbu ndị ahụ. Peter Obi arịọla maka olileanya Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa dịka osote onyeisiala n'okpuru pati PDP arịọla ndị Naịjirịa ka ha ghara ịda mba n'inwe olileanya gbasara ihe ga-eme n'ụlọikpe. O kwuru nke a n'ọgbakọ ndị isi a hụrụ kwaba okpu nke ndị PDP mere n'Ọka dị n'Anambara steeti, ebe ọ nọ kelekwaa ndị otu ya maka mbọ ha gbara oge ntuliaka. N'ofesi, Ndị ụlọọrụ ụgbọelu British Airways akagbuola njem niile kwesịrị isi Briten gaa Kairo dị na mba Ijipt n'izu a. Ụfọdụ ndị tọrọ n'ọdọụgbọelu ahụ na-eche etu ha ga-esi eme njem n'izu a Ha kwuru na ọ bụ maka ihe gbasara nchekwa ka ha ji kagbuo ya, mana ha ekwughi ihe ọ bụ kpomkwem. N'egwuregwu, Ndị CAF kwuru na goolu narị na abụọ e nyere n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ a bụ nke a kachasị nye n'ime otu asọmpi kemgbe e hibere asọmpi a. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro" afirika-51765253,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765253,Health and Wellness: Ihe ise ịgbaọtọ rahụ ụra ga-emere ahụ gị,"Irahụ ụra bụ otu ihe onye ọbụla na-emekarị n'abalị, nke bụ na ụwa dum nwere nkwekọrịta na irahụ ezigbo ụra na-edozi ahụ.","Ndị dọkịta apụtabeghị kwuo na e nwere nchọpụta gosiri na iyi akwa rahụ ụra dị mma karịa igba ọtọ. Mana ndị nkuzi maka ọdịmma ahụ na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha yipụ akwa rahụ ụra. Kris Ero bụ udiri onye nkuzi a gwara BBC ihe mere o ji dị mma mmadụ iyipụ akwa ma ọ chọo ịrahụ ụra. 1. Ọ na-eme ka okpofufu ghara inye gị nsogbu ma ị na-arahụ ụra Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị jụọ oyi . Nke a ga-eme ka ị rahụ ụra ọfụma. 2. Ahụ na-egbuke egbuke Maka na igba ọtọ rahụ ụra na-eme ka mmadụ rahụ ụra ọfụma, ọ na-eme ka ahụ maa mma. Otu nyocha e mere maka ịchọpụta ma arahụghị ụra a na-egbchi ohere ọnya mmadụ ịla ọsịsọ gosiri na inweta ezigbo ụra na-enye aka. 3. Ọ na-ebelata mgbakasi ahụ nakwa obi iko n'elu Ero kwuru na ọ na bụ ha na-agwa ndị bịara ikpesa na ha anaghị arahụ ụra ọfụma, ihe mbụ ha na-ajụ bụ ""akwa ole ka ị na-eyi n'ahụ were alakpu ụra?"" O kwuru na ha na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-agba ọtọ arahụ ụra ka ahụ dere ha duu ma mekwaa ka obi ha ruo ala. I teta n'ụra, ahụ agbasie gị ike. 4. Nsori ga-ana-atọwa nti Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka ahụ gị na onye nke gị (dị maọbụ nwunye gị) na-emetụta. Nke a ge-eme ka nsori na-atọ ụtọ maka na ahụ ụnụ ga-anabata nsori ọsịsọ. 5. Ahụ gị ga-eju gị afọ Ero kwuru na igba ọtọ rahụ ụra ga-eme ka onwe gị maọbụ ahụ ju gị afọ. N'okwu ya, onweghị ihe ịgwara onye na-agba ọtọ arahụ ụra ga-akụja ya. O kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị na-ahụghị ahụ n'anya na-agba ọtọ arahụ ụra. ""I na-ekpuchi ahụ gị site n'ụtụtụ ruo abalị, n'abalị yipu akwa gị niile ka ahụ gị kute ume. Akụkọ ndị ga-amasị gị Female Pilot: O nweghị ihe ọzọ m kaara ịme karịa ịnya ụgbọelụ" afirika-44327249,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44327249,Okwu Chimamanda maka asụsụ Igbo etinyela ọkụ na Soshal midia,Soshal media na-akpọtụ na Naịjirịa kemgbe nwanne ụnyaahụ maka okwu ada Igbo bụ Chimamanda Adichie kwuru na mkparịtaụka ya n'ụlọ ntaakụkọ New Yorker nwere.,"Adichie bụ onye na-agba mbo ihu na nwoke na nwaanyị nọ nhatanha N'ime mkparịtaụka ahụ, ka Adichie na aza aziza banyere etu o siri ahu asụsu Igbo na ụjọ ọ na-atụ na ya bụ asụsụ na-anazị ana, o kwuru na ndị Igbo toro na Legọs anaghị achọ ịsụ Igbo. ""Onyere ihe m na-akpọ, na mmegbụ o, ihere Igbo,"" Chimamanda kwuru. ""Ndigbo toro na Legọs na-agbara ịgbo ha ọsọ. Ị hụ ha n'ezi were gwa ha okwu n'Igbo, ha agaghi aza gị n'Igbo."" Okwu a, bụ nwaọbere ọkwụ ka ụwa dọgidere aka n'ime akukọ niile edere na ya bu mkparịta ụka n'tụtụ taa. Na Twitter, enwere ndị kwere n'ihe Adichie kwuru, ma kwuo n'eziokwu: Nicholas Ibekwe bu onye ntaakụkọ kwuru na enwere eziokwu di na okwu Chimamanda: @Tokwonna kwuru na-ebe ọ nọ, na ya bụ akụkọ dị mma maka ọ na-egosi ndị mmadụ na-akwadozi asụsụ Igbo. @Tokwonna gakwara n'ihu sị na Adịchie bụ ""efele nkụwa nke Igbo"" @edumontee kwuru sị ka ahapụ Adichie aka maka ọtụtụ ndị na-ako ya ọnụ bụ ndị akpọgara ala Igbo ha ga mụọ Igbo. @Omojuwa, bụ onye ama ama na Twitter kwuru na ọbụghị ihe Adichie kwuru na-ese okwu, na onwere ihe ọzọ mere ndị mmadụ jị ewere ya iwe. Mana, onwere ndị ekweghị na okwu Chimamanda kwuru. @tomisanokomi kwuru na ihe Adichie kwuru adabaghị ma chaa, maka na ndị Igbo ọ ma adịghị eme otu a. @reminola kwenyere n'ihe okwuru. @Duks_OG kwuru n'ebe ya na-arụ ọrụ, ndị Igbo na-asụ asụsụ ha, nke mere ya ejighị kwenye n'ihe Adịchie kwuru. Ka okwu a na-ada, ihe ndi mmadu ga na-ajụ bụ kedu nke bụ eziokwu." afirika-55028935,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55028935,Onyema Ogbuagu: Oge ọkammụta lụrụ ọkammụta ma mụta ọkammụta,"Ndị Igbo na-atụ ilu sị na ""ihe agwọ mụrụ ga-etorịrị ogologo"", ha na-asịkwa na ""nwa Agụ anaghị ata ahịhịa"".","Ọkammụta Chibuzo Ogbuagu, nwunye ya bụ Ọkammụta Chinyere Ogbuagu na nwa ha nwoke bụ Ọkammụta Onyema Ogbuagu Ilu a pụtara nnọ ihe na ndụ ọkammụta Onyema Ogbuagu, bụ nwa afọ Igbo nọ n'isi otu ndị chọpụtara ọgwụ mgbochi maka ọrịa coronavirus. N'izụụka ole na ole gara aga ka ụlọọrụ Pfizer n'Amerịka kwuru na ha arụpụtala ọgwụ mgbochi ọrịa coronavirus. Ụlọọrụ a sị na nnyocha ha gosiri na ọgwụ ahụ ruru ọrụ ruo pasentị 95 n'ibuso nje coronavirus agha. Mana dịka ụwa niile kpụzi Ọkammụta Ogbuagu n'ọnụ ugbua, ọbụghị mmadụ niile ma maka nne ya na nna ya, ha abụọ bụchakwa ọkammụta n'isi onwe ha. Ole ndị bụ Ọkammụta Chibuzo na Chinyere Ogbuagu? Ọkammụta Chibuzo na Chinyere Ogbuagu Onye bụ Dọkịta Onyema Ogbuagu? Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu bụkwa ụkpa ekele bunye nwa amadi a maka etu o si sonye n'irụpụta ọgwụ mgbochi covid-19 a ga-azọ ndụ ọtụtụ mmadụ. Agụmakwụkwọ na ọzụzụ Dọkịta Ogbuagu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Calabar nke Naịjirịa n'afọ 2003, Nwee ọzụzụ ndị dọkịta n'ụlọakwụkwọ ahụike Yale (Yale School of Medicine), Ụlọakwụkwọ ahụike Mount Sinai (Mount Sinai School of Medicine). O lere ule n'ihe banyere ahụike a kpọrọ 'Board Certification' na AB of Internal Medicine, Infectious Disease n'afọ 2012. Nturuugo Dọkịta Ogbuagu eritela nturuugo dị iche iche nke gụnyere; Nturuugo a kpọrọ Gerald H. Friedland maka ndị kachasị eme nyocha n'ụwa n'otu Connecticut Infectious Society n'afọ 2014 nakwa 2019. Dọkịta Ogbuagu dere n'akara twitter ya, sị na ime nyocha banyere ọrịa ndị na-efe efe na-esikaarị ọnwụ na-amasị ya. O meela nyocha banyere nje HIV, Coronavirus nakwa ọrịa ndị ọzọ na-efe efe. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik" 47905799,https://www.bbc.com/igbo/47905799,Chibok Girls: Anyị nwere olileanya na ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ga-alọta - Buhari,Buhari kwuru na ya echọzọbeghị nkwa ya kwere ịgbapụta ụmụaka Chibok ndị Boko Haram tọrọ afo ise gara aga n'ụlọakwụkwọ ha.,"Onyeisiala onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu kwuru na uche ya ka dị na nkwa ahụ o kwere oge ọ banyere ọchịchị agba nke mbụ. Ma kwukwa na gọọmenti na-agba mbọ iji hụ na atọhapụrụ ụmụaka ụmnwaanyị ndị e ji eji gụnyere Leah Sharibu. Ndị otu na-agba mbọ maka ntọghapụ ụmụaka ahụ mere ngagharịwe na Legọs ta iji cheta afọ 5 kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok. Otu a kpọrọ Bring Back our Girls maọbụ BBOG na Bekee mere ngagharị iwe taa iji cheta ha. Na foto BBC setere ha, ha yi akwa na-acha mmemme - bụ agwa eji mara ha. Ụfọdụ n'ime ha yi ọkọlọtọ dị icheiche na ngagharị iwe ahụ. Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Eprelu afọ 2014 ka ndị Boko Haram wakporo ụlọakwụkwọ Dapchi tọrọ ụmụaka 272. Ụlọnga ga-enwezị intaneti Gịnị ka a ga-ekwu maka mkpebi ndị ọchịchị Federal Executive Council ịmapụta ijeri naịra abụọ maka itinye ozi na-aga n'ikuku a kpọrọ ""digital connections"" n'ụlọ mkpọrọ? Joseph Daudu bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ọkaiwu na Naịjirịa, gwara BBC na ọ bụ mmadụ amaghị ihe dị mkpa, makana ụlọmkpọrọ ndị dị na Naịjirịa bụ agba ochie. Ndị agha adọọla ndị Sudan aka na ntị Ọ ka na-akpọtụkwa na mba Sudan ebe ndị agha napụrụ onyeisiala ha ọchịchị na-adọ ndị na-eme ngagharịiwe aka na ntị sị na ha agaghị anabata ọgbaghara. Otu ọnụ na-ekwuchitere ndị agha a kwuru na ha anaghị achọ ikike, kama na ndị agha ga-ahụ na ndị mba ahụ kwanyere onwe ha ugwu. Naịjirịa ga-amata ebe ha kwụ na AFCON tata N'abalịa ka a ga-ama ma isi Naịjirịa a ga-apụtakwa n'asọmpi Iko mba Afrịka a na-akpọ AFCON. A ga-eme ngụpụta ebe a ga-ama ndị ga-ezute ibe na otu ha ga-anọ n'ime ya. Ebee ka ị na-aga? Tụrụ ute gị bịa dina n'ọgbakọ BBC Igbo.com maka akụkọ bụ eziokwu ma pụkwaa iche. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe mere n'ụtụtụ. Christine Lagarde bụ onyeisi IMF Onyeisi International Monetary Fund bụ Christine Lagarde akpọọla gọọmenti etiti oku ka ha wepụ ego ha na-agbakwụnye iji hụ na mmanụ ụgbọala ndị ọnụ ala. O kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Tọsde n'ọgbakọ ịkwalite akụnaụba nke ụlọakụ mbaụwa hiwere na Washington, dị na mba Amerịka. Largarde kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti mee o tu a, ọ ka e ji ego ha nwetara tinye n'ọrụ n'ahụike, agụmakwụkwọ na iwulite ihe owuwu ndị na-akwado akụnaụba. O sị, ""Anyị kwenyere na iwepụ ego a na-agbakwụnye na mmanụ bụ ihe kwesịrị ekwesị. I lee anya. opekatampe e mefuru $5.2 million n'afọ 2015 nakwa mpụtara so ya. Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ego achọpụtala ndụ ole a kara ịzọpụta ma ọ bụụ na a na-akwụ ego ole kwesịrị maka mmanụ."" O ruola afọ ise atọrọ ụmụaka Chibok Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka Dịka ọ fọrọ ụbọchị abụọ iji mee afọ ise kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok, otu Bring Back our Girls ga-eme ngagharịiwe iji cheta ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ. A tọrọ ụmụakwụkwụ nwaanyị dị 272 (narị abụọ, iri asaa na abụọ) n'afọ 2014, e mecha a tọhapụ ihe dịka notu narị n'ime ha ndị e ji ndị Boko Haram eji eji gbara isi ha. Wike asaraala Amaechi aka udo Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike asapela aka mmezi nyere Rotimi Amaechi dịka ụlọikpe kachasị kụchapụrụ ikpe APC ịsonye na ntuliaka na Rivas steeti Wike kwuru na ọ ka ga-abara ndị steeti ahụ uru maọbụrụ na ha abụọ bịakọta ọnụ jịkọọ aka rụọ ọrụ maka ọganihu Rivas steeti. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43476022,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43476022,Mwakpo ọchịehi: Ọtụtụ mmadụ agbaala ọsọndụ na Kogi,Ọtụtụ mmadụ bị n'ime obodo dị icheiche na Kogi Steeti agbaala ọsọndụ maka ọtụtụ mmadụ egburu n'ịme steeti ahụ.,"Akụkọ kwuru na ndị gburu mmadụ gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ Cheta n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa nke a, ndị oji egbe a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi nwakporo obodo Agbenema, Aj'Ichekpa, Opada na Iyade nke dịcha n'ime Kogi. BBC Igbo kporo otu nwoke akpọrọ David Faruna bi bu na Abejukolo n'ime Kogi n'elu ekwenti, o kwuru na ya na ezịnaụlọ ya agbaala ọsọndụ. O kwuru na: ""ndị agha Naịjirịa ka nọ na-obodo ndi a oge mkpamkpa a mere. Oruola izuụka abụọ ndị a ji egbe na-egbu mmadụ mana anyị ahubeghị gọvanọ na-ebe a."" Faruna kwuru na ugbua sọọsọ mmadụ ole na ole bi na obodo ndị a makana onye ọbụla agbaala ọsọndụ nke ya. Onye na-eme ihe a? Ndị ọchị ehi ka ha na-ebo ebubo a. Ndị putara na ndụ sị na ndị ọchịehi na sị obodo baa obodo, na-egbu ndị mmadụ ma gba ụlọ ha ọkụ. A na-eche na ọ ndị Fulani na-akpa ike niile na-eme na etiti Naịjirịa Ihe mpkampka na-eme na Benue, Kogi, Platue na Taraba steetị ọfụma ọfụma. Cheta na ọ bụ na Benue ka ha gburu mmadụ iri asaa na isi n'ọnwa Janụwarị afọ a. Azịza nke Gọọmentị Ndị agha nọkwa n'obodo ndị a ha na-egbu ọtụtụ mmadụ. Gọọmentị ekwuole na mkpamkpa a ga-akwụsị ma ọ bụrụ na steetị di icheiche mụpụtara ọdọ ehị. Mana Faruna ekweghị na nke a, o kwuru na: ""ihe gọọmentị kwesịrị ịme bụ iji ike sa ike, sọọsọ ihe a ga akwụsị ogbugbu a na-eme na obodo anyị""" afirika-50202767,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50202767,EPL Results: Etu okwe si gbaa na 'Premier League' taa,Otu egwu bọọlụ dị icheiche a ma aha ha zutere onwe ha n'egwuregwu 'English Premier League' na mgbede Sọnde.,"VAR gụpụrụ goolu Sokratis nyere. Mana ọbụ ndị Arsenal ka obi kacha gbawaa n'ihi ihe igwe 'Video Assisted Refree' (VAR) mere ha. Arsenal na ndị Crystal Palace nyere onwe ha ọkpụ goolu abụọ abụọ. Mana 'VAR' gụpụrụ goolu nke atọ Arsenal nyere. Mana odochaghị anya ihe kpatara e ji gụpụ goolu ahụ. Ọbụkwa 'VAR' nyere penariti ndị Crystal Palace ji nye goolu mbụ ha Liverpool na Tottenham Jurgen Klopp Liverpool ji bọọlụ gbarie ndị Tottenham, mana goolu ekweghụ ha nnyete. Ha mechara were o jisi ike merie ya bụ asọmpị site n'inye goolu abụọ a satara otu. Jordan Henderson na Mohammed Salah bụ ndị nyeere Liverpool goolu ebe Harry Kane nyere nke ndị Tottenham. Manchester United na Norwich Ekwensu ndị Man Utd chọrọ ịbụ ha ọnụ taa mana ha mechara lafere. Ọkpụ goolu atọ asatara otu ka ha ji merie ndị Norwich. Ndị nyere goolu ahụ bụ McTominay, Marcus Rashford na Anthony Martial. Mana goolu ha gaara eru ise. Rashford na Martial tara penariti abụọ na asọmpi ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'" afirika-45269484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45269484,Canada etinyela iwu ga-eme ka ọ siere ndị Naịjirịa ike ịga mba ahụ,Mba Kanada etinyela iwu ọhụrụ maka ndị Naịjirịa batara mba ahụ maka ọsọ ndụ.,"Ndị ọkaikpe ndị kanada sị ndị be ya na-emegbụ ndị Niajịrịa Iwu a ga-eme ka ọhịa ahụ ịnweta ohere banye Kanada, mana ụfọdụ ụmụ Naịjịrịa si US gbaba Kanada ọsọ ndụ enwetere nkwado ndị ọkaikpe ụfọdụ na mba ahụ. Ndị ọkaikpe a kwuru na agwa gọmenti ala ha na-akpasọ ndị Naịjirịa a gbatara ọsọ ndụ be ha jọgbụrụ ụdele ma sịgbuo nkakwụ. Ọtụtụ ndị Naịjịrịa si ogige oke ala ndị US piofere kanada n'ihe ruru ọnwa iri na asatọ, bụ ebe ha chọrọ enyemaka ikike dịka ndị gbatara ọsọ ndụ. Ihe kpanitere mbuso ndị ọkaikpe a kpọrọ onwe ha Canadian Association of Refugee Lawyers bụ agwa akpasara otu nwaanyị Naiịjrịa chọrọ iji ọsọ agbalahụ ịbe ugwu nwaanyị na be ha. Ndị ọrụ okwu ndị gbara ọsọ ndụ dị n'aka bụ Immigration na Refugee Board (IRB) nke Kanada sị na ya bụ nwaanyị etozughị ịnye akwụkwọ ikike maka na-okwesiri ịgbaga ya bụ ọsọ ndụ na mpaghara ebe ndị ọzọ na Naịjịrịa dịka Ibadan maọbụ Pọtakọtụ. Ndị otu ikpe mkpegharị IRB kpebiri na ya bụ ikpe bụ ịhe a ga-eji elegara anya na-ikpebị ikpe ndị ọzọ gbasara ndị si Naịjirịa gbata ọsọ ndụ bido ụgbụa gawazịa. Ndị ọrụ IRB enwebuola ụdị mkpebị a na isi ndị mba China, India nakwa Pakistan. Ndị otu Canadian Association of Refugee Lawyers na-eche na-iwu a ga-eme ka ihe tawanyega akpụ nye ndị sị Naịjirịa gbata ọsọ ndụ karịa ka ọ dị na mbụ. Lorne Waldman bụ ọkaikpe na Kanada Onye ọkaikpe Lorne Waldman gwara ndị ntaakụkọ Reuters na olu sụpịrịsụpịrị na ""ya bụ mkpebi ezighiezi maka na ọ ga-eme ka ihe siere ndị ụfọdụ ike karịa ibe ha bụ ndị sị mba ọzọ"". N'ezia, Kanada na ihe na-eme kemgbe afọ 2017 bụ mgbe ndị mmadụ bidoro siwe azụ ụlọ US piobatawa mba ahụ. Ihe karịrị mmadụ 30,000 epiobatala Kanada kemgbe ahụ dịka akwụkwọ ndị gọmmenti mba ahụ kwuru. N'ime ndị a, mmadụ 10,000 si Naijirịa nke ndị Kanada nabatara pesentị 33. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43687801,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43687801,Brazil: Lula ebidola nga afọ 12 maka mmerụaka,Lula da Silva na-ebido mkpọrọ afọ iri na abụọ atụrụ ya maka mmerụaka ka o nyefechara onwe ya n'aka ndị uweojii.,"Lula da Silva chịrị onye zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ tupu o merie chịrị mba Brazil bido n'afọ 2002 rue 2011 Nke a mere ka ya na ndị uweojii mechara 'onye ga-ebu ụzọ tabie anya' abalị abụọ dịka ọ gbara ọsọ ndụ gbaga n'ụlọ otu na-ekwuchitere ndị ọrụ aka na mba ahụ oge ụlọikpe nyere ya iwu ka onyefe onwe ya. Ndị uweojii ji ụgbọala ha kwọrọ nwa amadị ahụ dị afọ iri asaa na abụọ, dịka o siri n'ụlọọrụ ahụ dị na obodo ya dị nsọ na Sao Paulo,pụta, ebe ọtụtụ ndị ihe ya na-amasị otu ya nọchiburu ụgbọ ahụ ịpụ. Lula kwụsiri ike na ikwu na aka ya dị ọcha ma kwuo na ya na-akwanyere iwu ụlọikpe nyere ka anwụchịe ya ugwu. A kwọrọ ya n'ụgbọelu gawa obodo Curitiba ị ga-ebido mkporo. Ndị na-eme ngagharịiwe gbara ... dịka ụgbọelụ ahụ na-ada, ebe ndị uweojii gbara ikuku-ose iji gbasa igwe mmadụ gbakọrọ. Ndụ ụlọọụ na agbanyụ okụ kwuru na mmadụ asatọ merụrụ ahụ, gunyere onye mgbọ rọba. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51385105,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51385105,"Imo State: ""Ihedioha kwado ịga mkpọrọ"" - Fada Mbaka",Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba.,"Ụkọchukwu Ejike Mbaka Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ. Ụkọchukwu ahu kwuru na afọ juru ya nke ukwuu etu ụlọikpe kachasị si kpee ikpe Ihedioha na Hope Uzodinma bụ onye nọchiri ya dịka gọvanọ ugbua. Ọnụokwu Mbaka Imo state: ""Ihedioha nwere ike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya"" - Mbaka Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgbagha maọbụ na-ekwu okwu ọjọọ maka amụma ya niile. Cheta na Emeka Ihedioha gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka, na a gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị. Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị Mbaka jikwa ohere ahụ tinye ọnụ n'okwu gbasara ndị ụkọchukwu ibe ya na soshal midia. Ọ kwara arịrị na ndị ụkọchukwu ibe ya bụzị ndị na-agba ya mgba ugbua na soshal midia. 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere' O kwuru na ọ bụ ihe ihere dịịrị onye ọbụla tinyere ọnụ na-akatọ ya n'ụdị ọbụla. Mbaka gwara ndị fada ibe ya nakwa ndị nkịtị, ka ha ghọta na onyinye dị iche iche. ""N'ihi ya, onye ọbụla ekwesịghị inwere m anya ụfụ n'ihi na amụma m na-emezu oge niile,"" ka o kwuru. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Jụọ ndị na-achị gị ihe ha ji akụnaụba ọha mee - Charly Boy" 49511876,https://www.bbc.com/igbo/49511876,Buhari in Japan: Kedụ nke bụ eziokwu banyere ọnọdụ njem Buhari na Japan?,"Dịka onye ndu otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na-ama aka maka ọnọdụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buahri na mba Japan, ọ gụpụtara ndị ntaakụkọ ọ si ""na-ekwu okwu asị"".","Kanu kpọrọ Channels TV, NTA na Legit.com bu ndị akụkọ ụgha, ma gakwa n'ihu sị na ""BBC Igbo esorola ha."" N'ọnụ Kanụ ihe ụlọ ntaakụkọ mere bụ ịgbasa ozi na Onyeisiala Buhari nọ na Japan maka atụmatụ nzụkọ mba ahụ na mba Afrịka akpọrọ ""Seventh Tokyo International Conference on African Development"" (TICAD7) n'obodo Yokohama dị na Japan. Kanu na uwe ndị Idoma Cheta na Maazị Kanu nyere ndi Ipob iwu ka ha nwụchịe Onyeisiala Buhari bụ onye ha sị na ọ bụ onye mba Sudan ha kpọrọ ""Jubril"". Kanu sịkwa na foto na ihe onyonyo ndị ntaakụkọ na-ewepụta bụ nke adịgboroja e ji teknụzụ ""Photoshop"" mepụta. Nnyocha BBC egosibeghị na- eji ""Photoshop"" mepụta ihe onyonyo maọbụ foto si nzụkọ ahụ na Japan. Foto si nzụkọ ahụ gunyere nke si akara gọọmentị Japan dịka nke ha tinyere na soshial midia ha nke gosiri onyeisiala ha bụ Sihinzo Abe ka ọ nọ na ya bụ nzụkọ. Foto ndị a gosikwara Onyeisiala Buhari na aka na-achi mba Afrịka ndị ọzọ ka ha na Onyeisiala Abe na-achịkọrịta ọchị. Ụlọ ntaakụko 'Ruptly' wepụtakwara ihe onyonyo gosiri mgbe Abe pụtara ise ya bụ foto. Onyeisiala Buhari na ndị ọzọ pụtara na ha bu ihe onyonyo. Onyeisi ụlọakụ maka mmepe Afrika a kpọrọ African Development Bank na Bekee bụ Akinwumi Adeshina wepụtakwara foto ya na Buhari sere na Japan. Ihe ọzọ nwekwara ike suo kpọm n'okwu na ndị ntaakụkọ adịghị atụ asị banyere ọnọdụ njem Buhari na Japan bụ foto a ebe ya na abe zutere n'ụbọchị nke iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọstụ. Buhari na Abe Agbanyeghị na ihe niile na-egosi na Buhari no na Japan, Ipob na Kanu ka na-asị na ọ bụghị eziokwu, ma kwuo na na ha na-esi imi n'ala achọgharịi ya na Japan. Kanu onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara na Facebook n'abalị Wenezde, kwuru na ""Ọ bụrụ na ọ na na Japan, ya pụta bịa fere ndị mmadụ aka."" ""Anyị chọrọ ijide ya ka anyị mee ya nnyocha 'DNA' iji mara onye ọ bụ n'ezie."" Kanu tụrụ ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina aka ebubo ikesa 'foto adigboroja' maka Buhari ịnọ na Japan. ""Foto na vidio e sere maka Buhari ịnọ na Japan bụ akpụrụ akpụ."" Maka BBC Igbo, Kanu sị: ""Ha (BBC Igbo) na-amaga ka ha bụ ndị anaghị ele mmadụ anya n'ihu mana ọ bụ asị."" Lee akuko ga-amasị gị" media-50165887,https://www.bbc.com/igbo/media-50165887,End SARS: Ndị Naịjirịa amalitela iti mkpu 'End SARS' ọzọ,Ndị Naịjirịa agbanyela aka n'isi ọzọ na-eti otiti sị ka a kwụsị ngalaba uweojii a kpọrọ SARS (Special Anti-Robbery Squad).,"Nke ugbua malitere dịka otu onye boro ha ebubo ịnwụchi ya ma mee ya ka ọ bụ onye ohi ka ha kwụsịrị ya n'elu ọgbatumtum dịka o si n'ụlọ enyi ya nwoke alọta. @Rayscode kọrọ etu ndị uweojii si nwụchikwaa nwaokorobịa ọzọ ha hụkwara n'ụzọ. End of Twitter post, 1 Nke a mere ka ndị mmadụ nọrọ na Twitter na-ekwuputa etu o si metụta ha, ma na-ekwu ka e mechie ngalaba SARS kpamkpam. @SnowChiff kọwara etu e si maburu enyi ya n'Enugwu steeti, ma kwuo na ha amaghị ebe e bu ha gaa. @hashtag2weets kwuru na ị bụrụ onye Naịjiria ma i soghi tie mkpu mmechi a, na gị mara na o nwereike irute gị mgbe ọzọ. Pịa #EndSARS na Twitter ka ị hụ etu ndị mmadụ si kọwaa ihe ha gabigara. Ọgụ chara n'etiti ndị ọkwọụgbọ tanka na ndị uweojii Ndị uweojii Legọs steeti na ndị Presidential Task Force akọwaala ihe mere dịka ọgụ dapụtara n'ogige Lillyport dị na mpaghara Ijọra na steeti ahụ taa. Akụkọ si ebe ahụ pụta kwuru na ọ bụ maka etu e si ana ndị na-anya tanka ụgwọ ụtụisi ha na-amaghị isi na ọdụ ya mere ka ha wee iwe, tụgharịa baa ndị uweojii ọgụ. Dịka akụkọ a si kwuo, ọgụ a tara isi otu onye na-agara onwe ya, mana ndị uweojii ekweghị ekwu ma ọ bụ ka ọ bụ asị. BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Bala Elkana, onye kwuru na ndị otu ya amaghị maka ya, kama na ọ bụ ndị Task Force a ga-ama maka ya. Ebe ndị nke Task Force na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii Legọs steeti kwesịrị ikwu ihe gbasara ya. Ozu mmadụ 39 a hụrụ na mba Briten A kpọpụtala aha Mo Robinson, si mpaghara County Armagh, dịka ọkwọụgbọala bu ozu ndị ahụ Akụkọ si mba Briten apụta na-ekwu na ozu mmadụ iri atọ na itoolu a hụrụ n'ime trailer n'obodo Essex ụnyaahụ, bụ nke ndị Chaịna. Ndị uweojii anwụchiela Mo Robinson dị afọ iri abụọ na ise maka ịkwọ ụgbọala bu ozu ndị ahụ. Egwu e birila ọkụ na Europa League Ndị na-akwado otu egwuregwu Arsenal nakwa Man United ga-ama ma ha a ga-ebu ọnụ alaba ụra n'abalị a mgbe ha ga-agba n'asọmpi Europa League. Ụzụ atụọ n'Enugwu maka ọkụ tanka n'akụkụ GOSHEM Estate Egwu bara ndị mmadụ ahụ ụnyahụ mgbe otu tanka bụ mmanụ petrolu wufuru ụfọdụ mmanụ ya n'Estate ọhụru n'akụkụ GOSHAM n'Enugu dị n'Enugwu steeti. Ya bụ akụkọ bịara na sochal media be ndị mmadụ na-eche na ya bụ ihe agbaghịzị aka. Ọnye ntaakụkọ anyị ga-etere anyị ka ihe sịrị kwuru ebe ahụ. N'aka ọzọ, dịka ọkọchị na-atụnye ụkwụ, gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akwala ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na steeti ahụ ka ha kee nkwụcha maka ọkụ ọgbụgba. N'ozi ahụ bụ nke odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Simon Ortuanya gụpụtara ndị ntaakụkọ, gọvanọ gwara ndị ọrụ mmgbanyụ ọkụ ka gagharịa mara ebe nwere ike iribido ha mperi ma ụdị ihe ahụ mee ma gwa ya ozigbo. Ndị NYSC erie ka bọsụ Nke pụtara n'abalị ụnyahụ bụ na ndị ji otu afọ efe alanna bụ Nigeria Youth Corpers na Bekee ga-eso rite elele na ụgwọ ọnwa opekata mpe gọọmenti etiti tinyere ndị ọrụ. Minista na ahụ maka ndị ndorobịa na mmegheri ahụ bụ Sunday Dare tinyere ozi a n'akara twitter ya n'abali ụnyahụ. Dare kwuru na Onyeisi ndị NYSC bụ Brig Gen Shuaibu Ibrahim ga-akọwa nrite ahụ mgbe ya na Minista okwu ego dị n'aka kpachara n'uzuụka ọzọ. Cheta na n'ọnwa Apreelu 2019 ka gọọmenti kwetere na ha ga-etinye ego n'ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ, ebe ha na otu ndị ọrụ kapịrị ya bụ nkwa ha kwere ha ọnụ n'izu gara aga. Buhari ekelele Trudeau maka mmeri ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ekelela ogbo ya nke Canada bụ Justin Trudeau maka mmeri o meriri na ntuliaka nke abụọ dịka onyeisiala nke mba ahụ. Buhari na-eche na mmeri ya ga-adọtị ọdịnamma Naịjirịa na Canada. Buhari sị na ya tụrụ anya na ahịa mba abụọ ahụ zụru afọ gara aga bụ nke ururu nde $948.4 ga-agba mkpị n'ọchịchị ọhụrụ ya a. O kwukwara na njem nlete otu gọvanọ mba ahụ bịara na Naịjrịa na afọ 2018 mere ka ọ mata ka Naịjirịa si etinye enyemaka mba Kanada n'ọrụ maka ndị mkpagbu Boko Haram metutara. Trump na Turkey N'ofesi, onyeisiala Donald Trump enweliela mmachipu gọmentị ya machiri mba Turkey. Nke a na-eme ka Russia na Turkey kwekọrịtara ịdowe ndị agha na okeala Turkey na Kurd maka ikwusi agha nke malitere ebe ahụ maka ọpụpụ Amerika. Turkey malitere ịbasa ndị Kurd agha mgbe Amerika kpọpụrụ ndị agha ha na mberede bụ ndị nọbụ nche n'okeala ahụ. Turkey na-ahụta ndị Kurd ka ndị agha omekataraihe puọ ụjọ. Mana ndị mba ụwa anaghị ahụ ha otu ahụ. The agha Kurd nyeere Amerika aka lụsa ndị ọmekataraihe pụọ ụjọ kporo onye ha ISIS agha na Syria. Agbanyeghị ụtọ Amerika na ndị Kurd, Trump kwuru na "" ndị ọzọ bịa lụtụ ọgụ n'ala nkwafu ọbara a"". Ọtụtụ mmadụ katọrọ ya bụ agwa Trump kpara ọkachasị ndị Pati Democrat nakwa ndị pati ya bụ Republicans otu o si gbahapụ ndị Kurd eleghị anya n'azụ, agbanyeghị ahụhụ niile ha so ha taa n'agha ISIS. Buhari agụgharịala aha ọzọ Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Rọshịa Onyeisiala Muhammadu Buhari agụgharịala Ministri na ahụ maka mkparịta ụka bụ Ministry of Communication aha ya. Malita ụgbụa, ya bụ Ministri ga-ebido ịzazị Ministry of Communication and Digital Development. Onyeisiala tinyere aka n'akwakwọ nyere ikike ka Minista na-elekọta ya bụ Ministri anya nwee ike ịgbanwe aha ahụ. N'akwụkwọ ahụ osete onyeisi mgbasa ozi Ministri bụ Philomena Oshodin tinyere aka, ọ sị na aha ahụ ga-eme ka ya bụ Ministri bụrụ ọgbara ọhụru n'ihe na nke mbụ a taala akị. Ọ sị na ya bụ aha ọhụrụ ga-eme ka Ministri ahụ nwee ike ịwebata mgbawe ọgbara ọhụrụ nke teknuzu n'usoro gọọmenti si eme ihe. Oshodin sị na ọ bụ ekpere Minista ya bụ Isa Ali Ibrahim Pantami ka onyeisiala zara ya. Barcelona na Slavia Prague Barcelona na Slavia Prague N'egwuregwu champions league agbara ụnyahụ, Barcelona pịara Slavia Prague ọkpụ abụọ asatara otu, ebe Chelsea ji otu ọkpụ merie Ajax. Liverpool jikwa ọkpụ anọ charaacha merie KRC Genk dịka Inter Milan ji ọkpụ abụọ merie Borussia Dortmund. Gee nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ụlọahịa mmadụ 68 lara n'iyi n'ahịa dị n'Obiagụ n'Enugwu Akụkọ kachasị" afirika-48565794,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48565794,Naira Marley: Ihe mere oti egwu a ka ji nọrọ na mkpọrọ,Onye oti egwu Naira Marley nke ezigbo aha ya bụ Afeez Eniola ka nọkwa mkpọrọ agbanyeghị na ụlọikpe nke ukwu dị na Legọs nyere ya ohere ka o si ụlọ na-abịa ikpe ya.,"Ọkaikpe Nicholas Oweibo ji nde naira abụọ na mmadụ abụọ nye Naira Marley akambee ka o sị n'ụlọ bịawa ikpe n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee. Oweibo si na ndị ahụ ga-enye ya akambee ahụ ga-abụrịrị ndị ọrụ gọọmentị ọkwa ha ruru ogogo iri, nwekwa ala n'ebe ụlọikpe ga-akwado. Cheta na ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Naira Marley ụlọikpe maka ebubo na aka ya dị na nrụrụ aka na mpụ. EFCC sị na akwụkwọ ""credit card"" ahụrụ na be Naira Marley nwere aha ""Nicole Louise Malyon na Timea Fedorne Tatar, bụ ndị amabeghi ndị ha bụ. Naira Marley gọrọ na onweghi ihe omere dịka EFCC na-ekwu na mpụ ha boro ya megidere iwu akpọrọ ""Money Laundering (Prohibition) Act and the Cyber Crimes Act"". Mana ugbua, ọ ka nọ na mkpọrọ maka onweghị onye ga-agbapụta ya. Nsogbu Naira Marley malitere mgbe odere maka ndị na-eme mpụ akpọrọ Yahoo Yahoo na Twitter na-asị na-ekwesighi ịma ha ikpe maka ihe ha na-eme. Mkpebi ya bụ na ndị ofesi were ihe ndị isi ojii la be ha mgbe ochie, ya bụ na ọ bụ ihe a ka ndị Yahoo Yahoo na anatagharị. Okwu nwuru ọkụ na soshal midia nke mere onye oti egwu ọzọ ama ama bụ Rugged Man jiri katọ ya." afirika-43242217,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43242217,Patị ọhụrụ: INEC a nabatala akwụkwọ narị otu na,Ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka na Naijịrịa akpọrọ INEC ekwuola na ọ nabatala ihe ruru narị otu na asatọ ndị tinyere akwukwọ idebanye parti ọhụrụ.,"INEC na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka ntuliaka nke 2019 ga n'ụzọ ziri ezi Onyeisi INEC bụ Ọkammụta Mahmoud Yakubu kwuru nke a n'emume gbasara mgbasa ozi ọhụrụ akpọrọ 'Social Media Week'. Cheta n'ụlọọrụ ahụ debanyere aha parti ndọrọndọrọ ọhụrụ ruru iri abụọ na otu na Dịsemba. Nke a mere ndebanye aha party ọhụrụ ruo iri isii na asatọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Yakubu kwuru na INEC na-elebanye anya na ya bụ akwụkwọ. Ọ sị na ụlọ ọrụ ya ga-anedebanye aha parti ọfụọ tumaadị ndị soro ụsọrọ INEC weputara. Onyeisi INEC kwuru na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụla chọrọ idebanye aha n'akwụkwọ n'ọnwa isi tupu ochichi eruo agaghị sonye na ntuliaka. O kwuru na obi dị ha ụtọ makana n'ime parti ọhụru iri abụọ na otu debanyere aha n'akwụkwọ, anọ n'ime ha bụ nwaanyi bụ ndi isi na ya." afirika-48780615,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48780615,War against drug abuse: Ihe ise ịṅụ ọgwụ ike nwere ike ime gị- Dọkịta,Otu onye seburu guff nke a kpọrọ 'cannabis' na Bekee agwala BBC Igbo na onweghị uru ọbụla dị na isi azụ.,"Ndi dibia bekee kwuru na ise anwụrụ ike na-emebi ụbụrụ isi Anselm Chukwu kwuru na o sere guff ọtụtụ afọ tupu ọ kwụsị. O kwuru na isonyere ajọ otu nakwa ndị ajọ enyi nwere ike ime mmadụ ka o bido sewe anwụrụ ike. Chukwu kwuru sị, ""A bụ m ganja man tupu m wụsa ọwa. 1. ""Ọgwụ ike ga-eme mmadụ ọgaghị arụnwụ ọrụ ọbụla bara uru."" 2. ""Ego gi niile ga na-aba na ya. 3. ""I gaghị enweta onwe gi ma ọbụrụ na ị ṅughị ya."" Ise igbo adịghị mma. Chukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ya ji aka ya kpebiere onwe ya ịkwụsị ịṅụ anwụrụ ike. N'otu aka ahụ, onye dibia bekee na-ahụ maka ndi nwere orịa isi aha ya bu Dkta Okoro Johnson Nwabueze gwara BBC Igbo na ịṅụ ọgwụ ike jọrọ nnukwu njọ. Dkt Okoro Johnson Nwabueze bu ọkacha mara n'ihe gbasara ọrịa isi O kwuru na: 4. ""ọgwụ ike na-emetụta ma onye na-aṅụ ya, ma ezinaụlọ ya nakwa obodo o bi n'ime ya."" 5. "" Ọgwụ ike nwere ike ịgbaka mmadụ isi"" Dọkịta Nwabueze bụ onye na-arụ na 'Federal Neuropsychaitric Hospital', Enugwu, kwuru na onye chọrọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike ga-ebu ụzọ nwee mkpebi n'obi ya ma gbaa mbọ gaa ụlọọgwụ ka e nyere ya aka. Abali iri abụọ na isii nke ọnwa Juun afọ ọbụla bụ ụbochị iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha zeere ịṅụ ọgwụ ike. Dịka ndị otu 'United Nations Office on Drugs and Crime' si kwuo, ihe dịka mmadu nde iri na anọ na ụma na-aṅụ maọbụ na-agba ọgwụ ike na Naijiria. Ha kwukwara na n'ime mmadụ anọ ọbụla na-aṅụ ọgwụ ike, otu bụ nwaanyị. Akụkọ ga-amasị gị: Nigeria VS Guinea: Lee ihe ụmụ Naijiria na ekwu maka mmeri Super Eagles meriri" 43041246,https://www.bbc.com/igbo/43041246,Ndị ọchịehi awakpola Akure South,Akụkọ na-apụta n'ekwu na ndị ọchi ehi awakpola obodo dị na Akure South na Ondo Steeti.,"Ihe mere ta bụ n'etiti onye ọrụ ụgbọ na onye ọchịehi Onye n'ekwuchite ọnụ ndị ụweoji na Ondo steeti bụ Femi Joseph kọwara BBC na ihe nke a mere eme mana amabeghị ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ maọbụ nwụọ anwụ. Joseph sị ịhe mere bụ na otu onye ọrụ ugbo nọ n'egbochi onye ọchịehi ị gafe n'ebe ubi ya nọ, ka ha na-akpa isi ụka, ndị mmadụ agbakọ n'ene ịhe na-aga. Nke a mere n'ebe a na-akpọ Futa North gate dị n'azụ ụlọọrụ ndị lokal gọọmentị n'ebe ahụ. Anwụchịri mmadụ abụọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ma o nweghị onye nwụrụ anwụ n'okwu nke a." afirika-51254304,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51254304,Tranmere Rovers vs Man United: Manchester United azaala 'Nna m agụ' taa,"A sị na onye hụ onye ọ ka ike, ọ dị ya ka a ga-asị ya gbuo ya.","Manchester United zutere ndị Tranmere Rovers n'asọmpi FA ma were ọkpụ goolu isii asataghị otu merụọ ha ahụ. Tupu e gbuo pịọm, Man United si n'aka Phil Jones nye goolu mbụ na nkeji 10. Na nkeji 13 tupu ndị Tranmere amara ihe egwu na-akụ Man United mezuru ya abụọ n'aka Harry Maguire. Goolu malitere izo ka mmiri na neeti ndị Tranmere na nkeji 16, 41, 45, na 56. Ụdị mmeri a Manchester United meriri Tranmere Rovers dị ka a ga-asị na ha akpala ike ka 'nna m agụ'. Ihe karịrị mmadụ 195 na-arịa iba Lassa na Naịjirịa Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi nfesasi ọrịa na Naịjirịa akpọrọ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwetela na ihe ruru mmadụ otu narị n'ụma na-arịa iba Lassa na steeti iri na otu. Ha kwukwara na mmadụ iri abụọ na itoolu anwụfuola maka ọrịa a. Onye isi NCDC bụ dọkịnta Chikwe Ihekweazu depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara nso nso a iji kowapụta etu nfesasi ọrịa ahụ si arị elu na steeti dị iche iche na Naịjirịa. Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na pasenti iri asatọ na itoolu(89%) ndị ọrịa iba Lassa ji si na Ondo, Edo nakwa Ebonyi. Kano sokwa n'ihi na Ihekweazụ depụtara na mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkịta Osagie Ehanire na ndị otu ya gara na steeti ahụ mgbe ha nụrụ na ndị ọrụ ahụike abụọ nwụrụ maka ọrịa ahụ na steeti ahụ. Lekwa ihe ndị ọzọ o kwuru na ngalaba ahụ na-eme maka ichekwa ụmụ Naịjirịa Mkpa mkpa Coronavirus na-akpa na China N'otu aka ahụ onyeisiala mba China Xi Jinping na-eti na ọrịa coronavirus ji ọsọ na ije efesasi na mba ahụ. O kwuru nke a n'ọgbakọ iji nabata afọ ọhụrụ ma na-eti na mba ya na-agabiga ọnọdụ dịka ili ọtụtụ mmadụ n'otu mgbe. Leah Sharibu a mụọla nwa? Ruo ugbua, onwebeghị onye be Leah Sharibu bụ nwata ụka Christ ndị Boko Haram tọrọ kamgbe afọ 2018, pụtaralanụ kwuo ma akụkọ na-efegharị na Sharibu mụrụ nwa n'aka ndị ntọ ya a bụ eziokwu maọbụ asị. N'egwuregwu, Chelsea mere ihe a tụrụ anya n'aka ha n'asọmpị iko FA dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie otu Hull City mgbe ha zutere onwe ha. Chọpụta ka Mancity na Fulham nakwa otu egwuregwu ndị ọzọ ga-esi chịpụ ya n'asọmpị a taa. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-akpalite mmụọ gị Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn" afirika-49177630,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49177630,Uloma Rochas: 'Ngagharịiwe ụmụnwanyị Imo mere ziri ezi',"Onye na-ekwuchitere Uche Nwosu bụ Jones Onwuanyasoanya ekwuola na ngagharịiwe nke ụmụnwanyị mere n'Owere n'ụbọchị Tuzde iji tie mkpu maka ụra a mara Uloma Rochas Nwosu, ziri ezi.","Ụmụnwanyị ndị ahụ chọrọ ka nwunye onyeisiala tinye ọnụ n'okwu ahụ Uloma Nwosu bụ nwa Rochas Okorocha ma bụụkwa nwunye onye zọrọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti na Pati ""Action Alliance"" bụ Uche Nwosu. Ụfọdụ ụmụnwanyị mere ngagharịiwe iji kwuputa mwute ha banyere otu ndị na-arụrụ gọọmenti Emeka Ihedioha si kpụọ Uloma Nwosu aka ntị abalị ole na ole gara aga. Oriakụ Nwosu kwuru na ndịọrụ gọọmentị mara ya ụra ma kpọọ ya aha ọjọọ dị icheiche oge ha bịara ebe ọ na-ere ahịa ibukọrọ ngwongwo ha sị na o zupuru mgbe nna ya bụ Rochas Okorocha nọ n'ọchichi. Ndị uweojii rịorọ ụmụnwanyị ahu ka ha jụlata obi. Ụmụnwanyị ahụ mere ngagharịiwe rịorọ nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari ka o tinye ọnụ n'okwu ma kwụsị nleda anya gọọmentị Ihedioha na-eleda ụmụnwanyị steeti ahụ. Mgbe BBC Igbo gbara Jones ajụjụọnụ, o kwuru na ihe ahụ e mere Ụlọma adịghị mma ịnụ na ntị ma ncha. O kwuru na ""ihe (Gọvanọ) Ihedioha mere jọgburu onwe ya."" ""Ụmụnwanyị ahụ mere ihe ha kwesiri ime dịka ụmụnwanyị. ""Onye ọbụla kwesịrị itinye ọnụ kagbuo ihe a Ihedioha mere."" Ụmụnwanyị ahụ kwuru na Ihedioha na-emekpa ndị otu APC ahụ BBC kpọtụụrụ Chibuike Onyeukwu na Steve Osuji bụ ndị na-ekwuru gọvanọ Emeka Ihedioha, mana ha abụọ azaghị ekwentị ha maọbụ zaghachi ozi e zigaara ha. Oge ya bụ ihe mere ọhụrụ, BBC Igbo kpọrọ Jasper Ndubuaku bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka iweghachị ihe gọọmentị e zuru ezu, o wee kwuo na o nweghị onye ọbụla mara Uloma ura. Mana ihe nkiri Uloma ziteere anyị gosiri ebe ọ dịka mmadụ amara ya ụra. Lee ihe nkiri ahụ ebe a: Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44220984,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44220984,Okorocha: Anaghị m apụ n'APC,"Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola na ọ gaghị eji maka onye ọbụla pụọ na pati ya bụ APC maka na o so na ndị bidoro ya na steeti ahụ.","Ha na-ebo Okorocha ebubo na ọ chọrọ ka ọgọ ya bụ gọvano Imo steeti O kwuru nke a ka akụkọ na-agagharị na ya bụ Rochas chọrọ ịlaghachị otu APGA bụ ebe ọ nọbu. Ọ bụ Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuchitere Okorocha zipuru ndị ntaakụkọ okwu a. O kwukwara na Okorocha anaghị apụụ na APC makana ọ bụ ya mụpụtara paatị a na steeti ahụ. Onwuemeodo n'ime akwụkwọ a dere na: ""Ọ bụ Okorocha mere ka APC bụrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị amaama na Naịjirịa maka ndị niile o kpọpụtere n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA."" O kwuru na ndị na-atụ asị na Okorocha apụọla n'APC na-eme ihe a makana ahụ na agbakasị ha, na kwa obi ha na-ama ha ikpe. Onwuemeodo kwuru na ndị na-atụ asị a amaghị Chukwu makana ha kwukwara na Okorocha tọgbọrọ atọgbọ n'ụlọọgwụ. Na ngwucha, o dere na Okorocha anaghị ekwe ka ndị a na-aghọrọ mkpụrụ n'ebe ha na-akụghị mkpụrụ." afirika-49842750,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49842750,Trump Impeachment:Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump,"Nke na-ewu n'Amerịka ugbua bụ atụmatụ nchutu onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump, onye na-ahụsị anya ka ụlọomeiwu nta mba ahụ malitere njem ịchutu ya.","Nancy Pelosi bụ onyeisi ụlọomeiwu nta fooro ntụtụ taa n'okwu ịchutu Trump dịka ọ sị na akaebe arụ ọ sị Trump kpara juru eju. Mkpa mkpa okwu a n'akpa n'ogige patị na-anọghị n'ọchịchị a kpọro ""Democratic Party"" kemgbe ọnwa ole ma ole gara aga. Ebe ndị pati 'Republican' na-agbajọọ ya. Okwu a tara akpụ maka na ụlọomeiwu abụọ na n'Amerịka (nke ukwu na nke obele) bụ ndị ga-etinye ọnụ n'okwu a ka onwe isi dị na pati abụọ na-achị mba ahụ. Dịka pati Trump bụ nke a kpọrọ ""Republican Party"" na Bekee ka nwee ike ma na-achị ụlọomeiwu ukwu, ndị Demokrat na-achị ụlọomeiwu nta. Ebu ha sị Trump kotere Onyeisiala Trump na Onyeisiala Volodymyr Zelensky nke Ukraine Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Onyeisiala Trump gwara onyeisiala mba Ukrane bụ Volodymyr Zelensky ka o nyochaa onye bụbụ osote onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden. Dịka Trump siri kwuo, Biden na nwa ya nwoke aha ya bụ Hunter Biden tinyere aka na nrụrụaka banyere ego mgbe nwa amadị ahu na-arụrụ otu ụlọọrụ na Ukarane ọrụ. Nke bụ eziokwu bụ na ndị Ukrane mere nyocha maka ebubo a ma sị na onweghi mpụ ha hụrụ. Nke bụ isi mmiri bụ na iwu Amerịka machiri onyeisiala mba ahụ ị sị ka mba ọzọ mere ya ihe ọma. Joe Biden no n'ihu ndị na-azọ ọchịchị ị bụ onyeisiala Amerịka n'afọ 2019 dika ndi ajụrụ siri họta Trump na-ekwu na ị sị ndị Ukrane nyocha Biden na nwa ya abughị inyere onwe ya ihe ọma. Ebe ndị ""Democrat"" gbara isi akwara sị na Trump dara iwu ụgwọ ya bụ ịchutu ya dịka usoro ha siri kwuo. Nke mere oji kara njọ, dịka ha siri kwuo, bu na Biden no n'isi ndị chọrọ ịna-apụ Trump ọkwa na ntuliaka 2020. Ugbua, akuko banyere ọnọdụ Trump ka bụ ihe obi iko n'elu. Usoro echi achutu onyeisiala n'Amerịka Dịka ọ dị ugbua, ọ bụrụ na ndị omeiwu kwenyere na o dara iwu, Trump nwereike iso n'ime ndị chịrị Amerịka a chuturu n'ọkwa, nke gụnyere Bill Clinton na Andrew Johnson." afirika-44738803,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44738803,Saraki: Ụlọikpe kachasị agọọlara m ọnụ,"Bukola Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naijiria kwuru na mkpebi Ụlọikpe mere n'ụbọchị Fraide, abalị isi nke ọnwa Julai, afọ 2018 bụ ịgọtara ya ọnụ ya.","Bukola Saraki bụbu Gọvanọ Kwara steeti tupu ọ banye ụlọomeiwu Saraki onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter, kwuru na 'Obi dị m ụtọ' na mkpebi ụlọikpe kachasị nke kwuru na ikpe ahụ kpụgharịrị ya ụbọchị 1018 bụ aka ọrụ ndị obi adịghị mma na ya ghọrọ onyeisi ụlọomeiwu ukwu. End of Twitter post, 1 Na mkpebi ya, ụlọikpe kachasị kwuru n'aka Saraki dị ọcha n'ebubo na ọ ghara ụgha banyere nkwupụta ihe o nwere, bụ ikpe dị na ụlọikpe pụrụ iche na-ahụ maka agwa ndị n'ọkwa ọchịchị nke a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal( CCT) na bekee. Ụlọikpe kachasị nke ọkaikpe Cletus Nweze kwudoro na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị mere ma tọpụ ya n'ebubo atọ ndị ọzọ. CCT nke onye ndu ha bụ Danladi Umar kagburu ikpe Saraki n'ihi na ndị akaebe na ihe akabe e wetara gbadoro ụkwụ na kepukepu, na abụghị okwu ahụrụ anya. Mana n'akwụkwọ nke gọọmentị etiti gbagharịrị, ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja n'ọnwa Disemba afọ 2017 wegahchiri ebubo atọ n'ime iri na asatọ(18 counts) nke CCT kụpụburu. Mana na mkpebi ya, Nweze kụpụrụ akwụkwọ nke gọventi etiti gbagharịrị. Nweze kwụrụ na ihe CCT kpebiri nke kwuru na ebubo niile ahụ gbadoro ụkwụ n'asịrị, na ndị butere ikpe akpọghị ndị nwere ihe akaebe doro anya ka ha gbaa akaebe.' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46254140,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46254140,Supreme Court: Buhari ekpunyela Musa Abji okpu dika ọkaipke ụlọikpe ukwu,Akụkọ dị mkpa: Ụlọikpe mkpeghari enwetala ọkaikpe ọhụrụ,"Onyeisiala Muhammadu Buhari enyeela Musa Abaji ọka dịka ọkaikpe nke ụlọikpe nke mkpecha. Akụkọ ntụrụ ugo Abaji a pụtara n'akara Twitter ndị ụlọomeiwu nke ukwu. Kọmịtị ọrụ agaala hụ nke bụ eziokwu n'ọrụ ụzọ gọọmenti Komitee na-ahụ maka ọrụ n'ụlọomeiwu nke obele nke Toby Okechukwu nọ n'isi oche ya nọ njem nyocha ọrụ gọọmentị etiti na arụgasị n'ala Igbo. Onye ntaakụkọ BBC so na njem a na-akọwa na kọmiti a ga-esi Enugwu, gawa onisha, ma nyocha ụzọ okporo a na-arụ na mpaghara ahụ. Ha ga-agatukwa ukwa n'ebe akwa ọhụrụ Naija dị. N'ofesi Kim Jong-yang bụbụ ọnọchịteanyaonye isioche Interpol Ngalaba uweojii ụwa niile nke akpọro Interpol ahọpụtara Kim Jong-yand dịka onyeisi ha. Maazi Kim, bụ onye South Korea, pụtara ka mba otu narị na iri itoolu na anọ so n'Interpol mechara ntuliaka eji ahọpụta onye ga-abụ isi oche ha. Kim meriri Alexander Prokopchuk bu onye Russia. N'Egwuregwu Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ Asisat Oshoala ekwuola na asọmpị otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Falcons na ndị nke Zambia ga-agba taa bụ nke ha ga emeriri ma ya bụrụ na ha chọro ịga ihu na iko mba Afịrịka nke ụmụnwaanyị. Ụmụnwaanyị South Afrịrịka meriri ndị Super Falcons n'asọmpị nke mbụ ha gbara n'iko mba Afịrịka nke afọ a. Gee nkeji n'uju ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ụgha gbasara Buhari Ndị na-agbasa akụkọ Jubril sị na ọ bụ ntị ya ka ha na-ele, mana nti Buharị nke aka nri na nke aka ekpe ya adịghị otu Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisiala n'ihe gbasara ikpe bụ Okoi Obono-Obla, edegarala otu nchekwa DSS nakwa ndị uweojii Naịjirịa akwụkwọ ozi ka ha nyochaa onye na-ebu akụkọ ụgha maka Onyeisiala Muhammadu Buhari. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, ọ na-ekwu ka ha nyochaa otu nwoke a kpọrọ ụkọchukwu Eze Orieke, maka akwụkwọ o kwuru si n'ụlọọgwụ London Bridge (Regional Medical Laboratory) o tinyere n'elu Facebook. Obono-Obla kwuru na akwụkwọ ndị Orieke wepụtara, gụnyere asambodo ọnwụ nke Bekee kpọrọ ""death certificate"", dị n'aha Buhari, nke o kwuru sị na ndị ngalaba ""National Population Commission"" dere n'ọnwa Septemba 2017. APC Imo steeti Uche Nwosu bụ onye na-atụ anya ịzọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'okpuru APC, ekwuola na ndị Imo kwesịrị ị na-ajụ ihe ọ ga-emere ha ma ọ bụrụ Gọvanọ, hapụ ị na-ekwu maka etu o si bụrụ ọgọ Rochas Okorocha. Okwu Uche Nwosu Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan agbaala ama na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji okwu ụmụakwụkwọ Chibok megide ya na ntuliaka 2015. Ọ tụkwara arịrị na nsogbu ịzụ vootu akarịala, ma kpọọ oku ka e wugharịa ebe a na-anọ eme ntuliaka nke Bekee kpọrọ ""polling booth"". Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Na mba ofesi, Ihe nwụrụ n'obodo Kabul eruola iri ise 50 ebe ihe ruru iri asatọ 80 merụrụ ahụ ka otu onye omekataraihepụọụjọ tụrụ ogbunigwe ebe ndị nkuzi ndị alakụba gbakọtara ime ncheta ọmụmụ Prọfet Mohammed. N'egwuregwu, Onye egwu Brazil bụ Neymar gbara bọọlụ naanị nkeji isii makana ọ merụrụ ahụ n'asọmpi enyi na enyi ha na Kamerun gbara ebe ndị otu ha meriri Kamerun. Cheta na Super Eagles nke Naịjirịa na Yuganda enyeghi goolu ka ha gbara onwe ha onye aba onye laba na nke ha gbara n'Asaba. Gere akụkọ BBC na nkeji ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lere ihe nkiri: Onye kachasị bụrụ nwata n'ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Chike Ukaegbu agwala BBC Igbo ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche. Chike Ukaegbu: O nweghi ihe jịkọrọ ndị kara nka na ọdịnihu anyị" afirika-43848440,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43848440,Nọt Koria akwụsịla mwale ngwọagha nuklia - Kim Jong-un,Onyeisiala mba Nọt Koria bụ Kim Jong-un ekwuola na ya akwụsịla mwale ngwọagha nulia ha chọburu ime ma mechikwaa ebe ha chọrọ ime nwale ahụ.,"A na-ele anya na Kim ga-akwụsị imepụta ngwọagha nuklia kpamkpam N'okwu ya; ""Bido n'ụbọchị 21 ọnwa Epreelu, Nọt Koria ga-akwụsị nnwale nuklia."" Kim kwukwara na nnwale ọhụrụ adịghịzị mkpa maka na ya egosipụala ikike ngwọagha nuklia nke Pyongyang. Nkwupụta a nke tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya na-abịa dịka Nọt Koria na-akwado mkparịtaụka pụrụiche nke ya na mba Sawụtụ Koria na mba Amerịka nwere. Kim kwesiri izute onye otu ya bụ onyeisiala mba Sawụtụ Koria Moon Jae-in n'izuụka na-abịa maka mkparịtaụka nke dị n'etiti mba ndị Koria abụọ ahụ nke a na-eme kamgbe ihe ruru afọ iri, ya na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-enwe mkparịụka nke ha n'ọnwa Juunu. Mba Sawụtụ Koria na mba Amerịka na-akwanye mba Nọt Koria kamgbe ka ha kwụsịngwọagha nuklia dịka ha gosipụtara nkwado nye Kim na nkwupụta ọhụrụ a. Trump nọọ'akara twitter ya gosi aṅụrị ya gbasara nkwupụta nke Nọt Koria dịka o kwuru na ọ bụ ezigbo agamnihu nye mba Koria niile ma na-ele anya maka mkparịtaụka ha. N'akụkụ nke ya, ndị Sawụtụ Koria kwuru na ihe ndị Nọt mere bụ ezigbo agamnihu nke ga-amịta ezi mkpụrụ na mkparịtaụụka nke na-abịa. O teela mba ụwa na-arịọ ka Nọt Koria kwụsị nnwale ngwọagha nuklia ha ebe Amerịka kwuburu na ha dị nkwade ibuso Nọt Kọria agha ma ọ bụrụ na ha kachie ntị. Mana mkparịtaụka nke Sawụtụ na US ga-eme ga-abụ mbụ n'ọtụtụ afọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45675417,https://www.bbc.com/igbo/45675417,#OsunDecides: Buhari ọ gwara ndị dara ntụliaka Osun okwu mgbawaobi?,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari e kelela pati ya nakwa Adegboyega Isiaka Oyetola, bụ onye meriri na ntuliaka e mere na Osun state ụbọchi September 27.","Buhari kelere Rauf Aregbsola maka etu o si chia ndị Osun ọfụma End of Twitter post, 1 O tokwara ndị ọzọ so zọọ ọche gọvnọ na steeti ahụ ma dụọ ha ọdụ ka ndị niile mpụtara ntuliaka a ejughị afọ gaa na ụlọikpe ga mee mkpesa. N'ozi onyeisiala sị n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya kwu bụ Garba Shehu, o kwuru na etu ntuliaka Osun state sị ga ọfụma gosiri na ọchịchị onyekwuo uche ya na-esiwanye ike na Naịjirịa. Buhari gara n'ihụ too ndị ụlọọrụ INEC maka na ha weliri isi Naịjirịa ma tokwa gọvanọ nke na-apụ na Osun steeti bụ Rauf Aregbesola maka etu o si chi ndị Osun steeti kamgbe afọ asatọ n'ụzọ ziri ezi. Ihe ndị mmadụ sara ozi na soshal: @patrickimoh kwuru na ọ bụ ihe ihere na onyeisiala depụtara udiri ozi a. @teryima_tsebo kwuru na ihe a gosiri ọchịchị aka ike karia ọchịchị onye kwuo uche ya. @godbentechmedia kwuru na ọchịchị Buhari akụzigoro onye ka a ga-esi ghọ aghụghọ na ntuliaka 2019. Mana e nwere ndị kwenyere na ya bụ ozi @dolutuyi kwuru na ndị ọjọọ bụ ndị na aghaghị a nabata ozioma a onyeisiala ziri. Oyetola je olori awọn osisẹ ni ọfisi Gomina Aregbesọla. Ntuliaka e megharịrị n'Osun steeti ụnyaahụ abịala n'isi njedebe, ebe otu na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission akpọpụtala Gboyega Oyetola dịka onye meriri na ntuliaka ahụ. Dịka Inec si kpọpụta, Oyetola ji vootu narị anọ n'ọma (482) wee gaa ogbo ya onye PDP bụ Ademola Adeleke. O nwere nchịkọta vootu dị ọnụọgụgụ 255,505, ebe Adeleke nwere nchịkọta ọnụọgụgụ dị 255, 023. Oyetola zọrọ ọchịchị ahụ n'okpuru pati APC bụ ndị na-esobu PDP n'azụ na ntuliaka mbụ e mere ụbọchị Satode gara aga abalị 22 Sepụtemba afọ 2018. Cheta na e megharịrị ntuliaka n'ụfọdụ ebe na steeti ahụ maka na Inec kagburu vootu ebe ndị ahụ. Mana ọnụọgụgụ vootu ndị a kagburu karịrị ndịiche vootu onye otu pati PDP ji aga onye nke APC. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51060277,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51060277,Ukraine Airlines: Iran ekwetela na ọ bụ ha gbaturu ụgbọelu PS752,Onyeisiala Iran ekwuola na ọ bụ ndị agha ha gbaturu ụgbọelu Yụkren.,"Ụgbọelu a dara ka o si Tehran fepu Na ozi odere n'akara Twitter ya, Hassan Rouhani sị na nyocha ha mere chopụtara na ọ bụ na-amaghị ama ka ejiri gbatuo ụgbọelu a n'obodo Tehran ma gbuo mmadụ 176 nọ n'ime ya n'ụbọchị 8 nke ọnwa Janụwarị. End of Twitter post, 1 Ụlọntaakukọ Fars deburu na onye mere ihe a nọzị n'aka ndị ọkaikpe ndị agha. Ha sịkwa na ndị agha Iran nọ na nnukwu njikere maka nkwa mwakpo Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na ndị ọchi agha ya kwere Iran. Ihe ọzọ ha kwuru bụ na ụgbọelu Yụkren a nwe akara PS752 na-efega ọdọ ndị agha Iran eji ""Islamic Revolution Guards Corps"" (IRGC) mara oge a gbaturu ya. Ụgbọelu dapụrụ n'elu ka obele oge gachara ndị Iran tụru ogbunigwe elu n'ọdọ ndị agha Amerịka dị na Irak. Ọkaiwu Malami si na okwu ụtụisi MTN dịzị n'aka ngalaba ụtụisi Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami awụsala mkpebi ya ịnata Ụlọọrụ mgbasaozi MTN ijeri naria abụọ maka ụtụisi. Malami kpebiburu na MTN ji ụgwọ ụtu isi a mana ọ sịzị na ọ bụ ngalaba na-ahụ maka ụtụ isi ka ya bu okwu dịzị n'aka Ohaneze na-akwado Amotekun Ohaneze Ndịgbo akwadola atụmtau ndị Gọvanọ ọdịda anyanwụ Naịjirịa wepụtara maka nchekwa akpọrọ Amotekun. Ọnụ na-ekwuru onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo bụ Emeka Attamah sị steeti niile nwere ikike ihazi nchekwa ha. N'egwuregwu, Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa Serena Williams gosiri Amanda Anismiova ihe ojiri buru Eze tenis ka ha zutere na asọmpị Auckland Classic n'ụtụtụ Satọde Serena di afọ iri ato na asatọ enyeghidị Amanda di afọ iri na asatọ ohere irite ihe ọbụla na ya bu asọmpị" afirika-50365661,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50365661,Emir Sanusi enyela iwu ka a nwụchie nne na nna ndị a tọrọ ụmụ ha,Eze ọdịnaala Kano bụ Emir Muhammadu Sanusi nke abụọ akatọọla ntọrị a tọọro ụmụaka na Kano ma kpọrọ ha gawa Anambara steeti.,"Emir Sanusi kwuru okwu a n'emume mgbasaozi otu a kpọrọ League for Societal Protection Against Drug Abuse (LESPADA) haziri na Kano. Ọ sị na ya na Obi nke Ọnịcha bụ Igwe Achebe ekwuola okwu maka ntọrị a ma kwukwa na ya na-eso etu o si aga kemgbe akụkọ banyere ntọrị a pụtara ihe. Kemgbe achọtara ụmụaka itoolu ahụ n'Ọnịcha, ụfọdụ mmadụ n'ugwu Naịjirịa na-akatọ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, bụ ebe ndị ntọrị a kpọgara ha. Emir Sanusi gbarụrụ ihu maka ụdịrị atụmatụ a ma sị na agwa ọjọọ enweghị agbụrụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na nne na nna nwere ebe ha si rie mperi na ntọrị ụmụaka ha. ""Ọ bụrụ na ị na-eche na ọ bụghị n'aka nne na nna ka o si, gaa Ọnịcha gaa nwaa ịtọrị nwata ka ị chọpụta na ị gaghị emenwu. ""Anyị kwesịrị ịgbanwe etụ anyị si eche uche ma kwụsị ịta ndị ọzọ ụta maka nsogbu dị na be anyị."" Sanusi sị na ha anaghị ekwu na ndị ntọrị emeghị ihe ọjọọ, kama na ihe ya na-ekwu bụ na nne na nna kwesịrị ịgba mbọ tinye anya n'ebe ụmụ ha nọ. Ọkwu a Emir Sanusi kwuru mere ka ọtụtụ mmadụ gbarụọ ihu na Twitter. Ndị sị na okwu ya adabaghị: Nakwa ndị nke sị na ihe o kwuru dabara: Ndị uweojii nwụchiri mmadu asatọ ha si aka ha dị na ntọrị ụmụaka itoolu ahụ dị afọ abụọ ruo iri. Ha enyefela ụmụaka ahụ ndị nwee ha. Onyesisi ndị uweojii na Kano steeti bụ Ahmed Iliyasu sị na atọrọ ụfọdụ n'ime ha n'afọ 2014. Ihe nkiri ga-amasị gị: Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa" 49966978,https://www.bbc.com/igbo/49966978,Aba fire disaster: Gọọmentị Abịa state ehibela kọmitii ga-etinye anya n'ọkụ gbara n'Aba,"Gọọmenti Abia Steeti ehibela kọmitii ga-enyoba anya n'ọkụ gbara n' Umuosi, Degema na Anaba street n'Aba, Abia steeti n'ụbọchi iri abụọ na asaa nke ọnwa September 2019.","Gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka kọmitii a tinye anya ma chọpụta ihe kpatara ya bụ ọkụ gbara ụlọ asatọ na ogbe ahụ. Ha ga-achọpụtakwa egoole ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ ọkụ gbara pụtara. Kọmitii a ga-etinye anya na mmiri chọpụta ndị kpara ya bụ arụ ka e were kpụpụ ha ụlọikpe ma maa ha ikpe ka okwesiri. Dịka John Okeiyi bụ Komishona mgbasa ozi dị n'aka si depụta, ndị nọ na kọmitii a bụ: 1. Chief (Dr) Ukpai Agwu Ukpai (Onyeisi) 2. Mr Sopuruchi Ernest Beke (SOP) (Onye otu) 3. HRH Eze Sunday Emejiaka (Onye otu) 4. Dr NCNC Okoli (Onye otu) 5. Rev. (Dr) Ogboso Ejindu (Odeakwụkwọ) Enyere kọmitii a izuụka abụọ ịme nchọpụta ndị a ma degara Gọvanọ akwụkwọ maka nke a. N'aka ọzọ, otu na-ahụ maka mekọrịta ndị agha na ndị mmadụ bụ nke na-anọghị n'okpuru gọọmenti gara njem nleta na ebe ya bụ ọkụ mebiri ihe. Nelson Nwafor onyeisi ndị otu na ahụ maka mmekọrịta ndị agha na ndị nkiti Dịka onye ndu ha bụ Comerade Nelson Nwafor si kwuo, ""Ihe anyị huru ebe ahụ na-agba anya mmiri"". Nwafor sị na ndị otu ha gbara mmadụ iri na anọ ajụjọ ọnụ n'ebe ahụ. Ha sị na onu mmadụ niile ahụ dakọrọ na-ịkagbụ agwa ndị uweojii bụ ndị ha na-ebo ebubo okụ ahụ. Ndị uweojii agọkwaala ụkwụ na aka ebe ha hibekwara kọmitii nchọpụta nke ha. Ndị otu a sịkwa na ogbe ahụ ka dịkwa ka ebe ọsọ gbara maka ndị uweojii na-abịa ebe ahụ akpara ndị mmadụ. Lee ihe nkiri a 'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ' Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45692201,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45692201,Gịnị mere ọsọ ji ata n'APC?,"Ama ya dịka 'mama Taraba' mana ụbọchị Septemba 29, 2018, Aisha Alhassan wepụtara akwụkwọ arụkwaghịm nye onyeisiala Muhammadu Buhari.","Alhassan natara onyeisiala ikike ịzọ oche gọvanọ n'ọnwa Ọgọst Alhassan pụrụ n'otu APC, ma ritukwaa n'ọkwa ya dika minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Lee ihe o depụtara n'elu Twitter ya: End of Twitter post, 1 ""Taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba nke afọ 2018, ọ bụ ebumnobi m ime ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mata mkpebi m itinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa nakwa dịka onye otu ""All Progressives Congres"" (APC). N'ime akwụkwọ arụkwaghịm o depụtara onyeisiala, o kwuru na ọ bụ maka na-enyeghị ya ohere ị zọ oche gọvanọ n'otu APC mere o ji puo n'otu ahụ nakwa na ọkwa ya dịka minista. O kwuru na ihe gbagọjuru ya anya bụ na ọ nweghị ihe ndị isi pati APC kwuru bụ ya kapatara e ji kwụsị ya ị zọ ọchịchị. Chetanu na onye onyeisiala Naịjirịa nabatara ebumnobi Alhassan mgbe ọ rịọrọ ya ikike i zọ ọche gọvanọ Taraba steeti. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkpebi Mama Taraba: @Naijapoet kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obi mana ụta diri Alhassan makana ọ rụghị ọrụ ya ọfụma. @GimbaMamu kwuru na ọ bụ makana Alhassan na-kwado pati ọzọ nabụghị APC. Mana @ilmanati kwuru na ọ bụ iheoma ma tokwa Alhassan. @shamonk kwuru na n'agbanyeghị etu ndị APC si ahụta Mama Taraba , ọ ga-amitanwụrụ ha mkpụrụọma. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51765248,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51765248,Nigerian Foods: Lee uzọ iri ị ga-esi sie akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị,"Ọ karịala afọ narị ise gara aga akpụ batara Afịrịka, ma turuzie ugo n'ala Igbo.","Ọ bụ nri na-enye ọtụtụ ndị na-eri ya ume. A sị na onweghị ụzọ isi jewe Ọnicha ọ dị mfe mana nke a abụghị maka akpụ, makana ma onye ukwu ma onye nta ga-egotenwu, ga-esinwu ya ma na-erinwu ya. Enwereike ịbacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri. Enwere akpụ na-atọ ụtọ nakwa nke na-enu inu. Lee ụzọ iri i ga-esi mee akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị. 1) Ịsụ akpụ asụ Nke a ka ndị Igbo na-akpọ ""santana"" ma ahazicha ya n'efere. I jụọ m ihe eji akpọ ya, amaghị m nwanne mana otu ihe m mara bụ na akpụ asụrụ asụ na ofe onugbu, ọra, egusi na nsala dị dịka di na nwunye na-ekweghị agba alụkwaghịm. Lee ka esi esi akpụ asụrụ asụ Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere 2) Abacha agwọrọ agwọ Onye ọbụla na-eribeghị Abacha agwọrọ agwọ amaghị ihe ọ na-ekwofe makana ya bụ nrị bụ elelebe eje ọrụ ma ịhazicha ya. Eji okporoko, anụ Kanda, azụ, anyara nakwa ihe ndị ọzọ na-adọ n'akpịrị were ahazi ya. E nwere obodo ebe Abacha bụ ọjị a ga-enye gị tupu ebutezie nri ị ga-eri. 3) Nke a atọ bụ Garri Nwanne o nwere ndị Garri na-ejere ozi ka ọ bụ odibo ha. Ụfọdụ na-asị na akpụ asụrụ asụ na-esi ha isi n'aka ya mere ha ji ekopu ma ị nye ha Garri na ofe. Garrị bụ akpụ ebechara, kwụọ ya, wunye n'akpa ma kwe ka ọ gụchasia mmiri tupu eghe ya nke ọma ka ọkpọ ọfụma. Ọtụtụ mmadụ na-aṅụ Garrị dịka mgbadoume eji eche nri ka oghe. Ya bụ nri kacha dị fecha fecha ime mana ka m kuziere gị ka ị ga-esi mee Garrị ị na-anụ anụ ka ọ tọwaa nti. Ka esi mee ya Chaị akpịrị gị akwụrụla ọtọ ugbua!! 4) Achicha bekee Echekwala na ọ bụ naanị ọka maọbụ Witi akwọrọ akwọ ka eji eme achịcha. Ị ta nke eji akpụ akwọrọ akwọ wee mee ị ga-achịkọrọ ihe niile i nwere nye onye nwere ya. A na-eji akpụ na-enu inu eme ya. Ka esi mee ya 5. Akpụ Mmiri Ị na-arụ oke ọrụ tụmadị oke anwụ na-acha gị, akpụ mmiri juru oyi na akụ oyibo ga-abịanyụ okpofu maọbụ mgbakasị ahụ na-eme gị. Ọ naghị ahịa ahụ omume. Ka esi eme ya 6) Stachi a na-elo elo Nri a dịka nwaanyị e ji eje emume maka etu o si acha. Ndị Delta steeti ejighị ya egwu egwu . Ha na-eji ofe a na-akpọ banga were eri ya. Ụfọdụ ndị sikwa na mpaghara ala Igbo na-erite ya ọfụma. Ka esi eme ya Stachi gị eyelaaa!! 7)Kpekere eji akpụ eme Nwaanne echekwala na ọ bụ sọ ọgede maọbụ unele na ji ka eji eme kpekere. Ejikwa akpụ eme ya. Ọ hịaghị ahụ. Mana ọ bụ ndị Ashịa na-emekarị ya. Ka esi eme ya Ị ga-atalị nke a ebe ọbụla ịnọ 8) Akwụkwọ akpụ bụkwa egwu eji Akwụkwọ nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ. Ọ dị mma oriri maọbụrụ na ịgbakpọcha ya. Nke a ga-eme ka 'Hydrogen Cyanide' dị n'ime pụcha ka ọ ghara igbu mmadụ. Ụfọdụ na-eji ya esi ofe tụmadị ndị mba Centralụ Afịrịka, Sierra Leone na Liberia. 9) Eji akpụ ese nrị A na-eji karị ofe ọgbọnọ eri nrị osise 10) Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ: Akụkọ ndị ga-amasị gị Amputee Model: 'Mmadụ agaghị afụ gị n'anya ma ọ bụrụ na ịhụghị onwe gị n'anya'" afirika-54143985,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54143985,Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe o merela kemgbe afọ 13 ọ malitere ịnọchite Abia-South,Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia-South n'ụlọomeiwu Naịjirịa akọwaala ụfọdụ ihe ọ rụrụ kamgbe ọ banyere n'ọkwa Sịnetọ.,"Ọ sị na otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o mere bụ iwepụta atụmatụ ịkwalite ihe ndị a rụpụtara n'Aba nke a kpọrọ 'Made in Aba'. Ọ sị na ihe mere o jiri malite nke a bụ maka na ""ọ na-aka mma isi n'ụlọ mara mma pụwa n'ama"". Abaribe sị na ụfọdụ ihe ndị ha kwadoro gụnyere ịrụpụta akpụkpọ ụkwụ, uwe ndị nchekwa gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị Civil defence nakwa uwe ndị ji otu afọ efe ala nna ha.dgz. Ọ sị na ọ bụ maka mbọ a ha gbara mere gọọmentị Naịjirịa ji malite atụmatụ nke ha a kpọrọ 'Made in Nigeria'. Ihe ndị ọzọ Sịnetọ Abaribe sị ha mere gụnyere ịrụ okporoụzọ, ịgbape mmiri, ịrụ ọkụ latrik izụrụ ndị mmadụ ụgbọala na ọgbatumtum na ihe ndị ọzọ. Kirie ihe o kwuru n'uju Ndị mer akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Chiemela Peter Mgbeahuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49328773,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49328773,BBNaija: 'Aka anyị adịghi na ihe nkiri Kaffy na-eme' - Uweojii Ingland,Ndị uweojii nke Ingland bụ 'Metropolitan Police' (Met) ekwuola na ha na-enyocha onye otu ha bụ Kaffy Kareem Ahmed nke na-eme ihe nkịrị 'Big Brother Nigeria'.,"Rebecca Byng bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi ndị uweojii 'Met' gwara BBC na ha ma na nwaada ahụ soro na ihe onyonyo ahụ, kama ha na-enyocha ya n'ụzọ nke ha. O kwuru sị, ""Otu onye uweojii nke ngabala 'Transformation Command' dere akwụkwọ ka e nye ya ikike i so n'ihe nkịrị nke onyonyo, kama enyeghị ya ikike"". Byng gara n'ihu kwuo sị, ""Anyị ma na onye uweojii a so na ihe nkiri a ma ọ na-eme n'ike nke ya."" O kwukwara sị na Met akwadoghị onye uweojii ha iso na ihe nkiri a ma kwukwa na o nweghị otu o siri metuta 'Met'. Byng gwara BBC na ha na-atụanya na onye uweojii nke Met ọbụla ga na-akpa ezi agwa ma ọ nọ n'ọrụ ma ọ nọghị n'orụ. ""Ndị na-akpa agwa na ezighi ezi nke megidere ụkpụrụ ndị uweojii 'Met' ga-anata ntaramaahụhụ kwesiri ekwesi."" Ọ gwakwara BBC na Kaffy Kareem Ahmed anarala ezumike akwụghị ugwọ tụpụ ọ rịọ ka o soro n'ihe nkiri onyonyo. Ka ọ dị ugbua, Kaffy nọ ezumike. Ndị na-elekọta Kaffy Kareem dịka onye na-eme ihe onyonyo edeputala akwụkwọ ebe ha na-akwado ya. ""Khafi bụ nwaanyị onyeisi ojii ụ onye nweojii nke ji ọrụ ya meme ọnụ ma were ndụ agbọghọbịa ya na nka ya nke gụnyere ịma asụsụ mba ise were ya arụ ọrụ."" Lee Akụkọ ga-Amasị gị Lee ihe Nkịrị a 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk" afirika-44896714,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44896714,Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter,Ụlọọrụ sochal midia na-ewu ewu bu Twitter emela onye bụbu minista na-ahụ maka ego na akụnaụba na Naịjirịa bụ Ngozi Okonjo-iweala onye ọrụ ha.,"Okonjo-Iweala dere akwụkwọ maka mpụ na awaụwọ dị na gọọmentị mgbe ọ nọ ọrụ obodo Okonjo-Iweala ga-arụ ọrụ dịka otu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na ""Board"" ndị Twitter. Okonjo-Iweala ruburu ọrụ na ọchịchị Olusegun Obasanjo site afọ 2003 ruo 2006 na Goodluck Jonathan site 2011 ruo 2015. ""Anyị na-agba mbọ ịhụ n'ụwa anyị dị mma , Twitter nyere ohere ịgbasa ozi ma mee ka mkparita uka mmadụ na ibe ya maka ihe na-eme n'ụwa mụbawanye,"" bu ihe Okonjo-Iweala kwuru na ozi ozipuru. Okonjo Iweal bụ onye a na-ukwanyere ugwu maka ọru ọ na-arụ na World Bank. O dere akwụkwọ na nso a maka ihe ọ hụru n'ọchịchị Jonathan. A ha akwụkwọ a bụ ""Fighting Corruption is Dangerous: The Story Behind The Headlines"". Twitter nwere mmadụ nde 336 na-apị akara ha kwa ọnwa. N'Afrịka, ndị mmadụ kwadoro Twitter, bu ihe ha ji akparịta ụka banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ. Okonjo-Iweala jikwa Twitter nabata ọkwa ọhụrụ a: Ma kelekwa onye ọrụ a Twitter zipuru ozi a na mbụ. Nke a bụ ugo ọzọ Okonjo-Iweala ga-etinye na ndị nke onweburu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46546396,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46546396,South East Development Commission Bill: Kedụ uru ọ ga-abara Igbo?,Ụlọomeiwu ukwu etinyele aka nkwado n'akwụkwọ iwu maka imepe South East Development Commission bụ kọmishọn nke ga-ahụ maka mmepe na steeti ise dị n'Alaigbo.,"Dịka Sinetọ Stella Oduah na Samuel Anyanwu , bụ ndị tọrọ ntọala akwụkwọ iwu kọmishọn ahụ siri kwuo. ọ ga-enye ""Ndigbo oke ruru ha"". N'ichafụ, Oduah kwuru an akwụkwọ iwu a ga-anọ ruo afọ iri bụ mgbe atụru anya gọọmenti ga-eji rụpụta arụ niile okwesiri ịrụ. Ya bụ kọmishon nwere ike imechi ma ọbụrụ na ndị ụlọọmeiwu nabata atụmatụ onyeisiala ime otu ahụ. N'otu aka ahụ, Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye nnọchite anya Abia-South n'ụlọomeiwu ukwu sị na ya bụ akwụkwọ iwu ga-ehicha Ndigbo anyammiri maka mmebi na mkpochapu mere Igbo oge Agha Biafra. Enyinnaya Abaribe Ọ sịkwa n'udo na mgbaghara e kwere Igbo na nkwa kemgbe a lụchara agha Biafra apụtabeghị ihe. N'olu ya, ""ọ bụ ya ji anyị n'ala ruo ugbua"". Abaribe sị na gọọmenti kwesiri iji ọsọ ha ji mezie Ugwu Awusa kemgbe ọgụ Boko Haram were mezie Igbo bụ nke a hapụrụ kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ. Ọ sị na akwụkwọ iwu ahụ ga-ebute ezigbo nnabata na mmekọrịta kemgbe a lụchara Agha. ""O nweghị onye Igbo ga-ahụ ka ọnọdụ Alaigbo dị sị na ọ dịrị anyị mma"". ""Bil a ga-enye ohere ka anyị bụ Ndigbo jiri aka anyị na-ekwu ihe anyị chọrọ ịrụ na be anyị."" Mgbe BBC jụrụ Abaribe ebe ego a ga-eji rụọ ọrụ na kọmishọn a ga-esi pụta, Abaribe sị na "" gọọmenti steeti ga-enwepụta pasenti iri n' ego gọọmentị etiti na-enye ha n'ọnwa were tinye pasenti iri na ụmụ bụ nke gọọmenti etiti n'onwe ha ga-etinye na ọbaego kọmishọn a"". Ebe ahụ ka gọọmentị ga na esi eweta ego ha ji arụ ọrụ. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-48421400,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48421400,Rochas Okorocha: A hapụrụ m naira 42.5b n'ọba ego Imo steeti,Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ hapụrụ ego ruru Ijeri naira iri anọ na abụọ n'ụma (N42.5 billion)n'ọba ego Imo steeti.,"O kwuru na ọ chọrọ ka Emeka Ihedioha na-abata ọkwa gọvanọ ghara inwe ihe ọbụla ga-ebochi ya ịrụpụta ọrụ gọọmenti. O kwuru nke a mgbe ọ na-ahọpụta ndị odee akwụkwọ na onyeisi ndị ọrụ steeti ya. Ọdachị eriele isi mmadụ isii na Plateau steeti Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Ndị omekome egbuola mmadụ isii n'otu ezinụlọ n'okpuruọchịchị Riyom dị na Plateau steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Matthias Tyopev kwetere na ihe mberede a mere mana ọ matachabeghi ka o si mee. Mbanye ọchịchị ọhụrụ Dịka Legọọs na Abia steeti nwurula ọkụ maka nnyefe aka ọchịchị ọhụrụ 2019 na-enwuru ọkụ na Naịjirịa. Gọvanọ Abia steeti na-enyefe onwe ya ọchịchị hibere ọgbakọ ọ ga-eji gosi ndị steeti ahụ ka ọ ga-esi chịa ha n'agba nke abụọ ya. Gọvanọ meriri na Lagos bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na gọvanọ Ambode na-apụ apụ enyefela ọchịchị Lagos n'aka ya tupu echi bụ mmemme nyefaka ọchịchị eruo. Buhari emepela iko mmanya ọchịchị agba nke abụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ji aha pati APC azọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na dịka ọ na-abanye agba ọchịchị nke abụọ na ọ ga-agba mbọ hụ na ndị uweojii na ndị ọkaiwu rụrụ ọrụ ha ọfụma. Ọ rịọrịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gba ndị omekome nọ n'agbataobi ha n'anwụ ka obodo naịjirịa nweike ịdọbata ndị oji ego achụ ego si mba ofesi. N'ofesi Ụlọikpe di n'mba South Africa akpụpụla Nwoke ọnye isi ọcha south Africa aha ya bụ Adam Catzavelos ikpe maka ihe onynyo ịkpa Oke agwụrụ ọ mere. O mechara zipu ozi rịo mgbaghara sị na ọ bụ aghọtaghị , kwu kwa na ọ ga eji ndu ya nile echegharị agwa ọjọ ọ kpasoro ndị isi ojii na mba South Africa. Ọtụtụ anwụọla na nrigoro Ugwu Everest Nepal a gọọla na nnọkọ mmadụ karịrị n'etu kpatara ọnwụ ọtụtụ Ka akụkọ na-aga, a na-ekwu na ihe karịrị mmadụ iri anụọla n'ugwu Everest kemgbe afọ a. Ọgụ n'ụlọ mkpọrọ na mba Brazil ataala isi mmadụ Obi gbawara ndị be ndị nwụrụ n'ihe mberede a Mmadu iri anọ anwụọla n'ọgụ dara n'ụlọ mkpọrọ dị na mba Brazil dịka egbuchara ndị ụlọ mkpọrọ iri na ise na ọgụ dara ụbọchị Sunday gara aga na mba ahụ. Ndị ọrụ mkpọrọ na-ekwu na o nwereike ịbụ enweteghị ikuku ọfụma kpatara ọnwụ ndị a. Na Japan Ndị gbata gbata na-agwọ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede a Oji mma egbu awakpola ụmụakwụkwọ nọ na ebe ha na-eche ụgbọala ha ji a ga ụlọakwụkwọ na mba Japan Mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo. Nwata dị afọ iri na otu nakwa nwoke dị iri atọ na itoolu so na ndị eji mma mabuo n'ihe mberede a. N'egwuregwu Ramos bụ ọkachasị agba bọọlụ na Real Madrid Onye na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid bụ Sergio Ramos ekwuola na ọ chọrọ ịpụ n'otu ahụ na-akwụghị ụgwọ orire ya. O kwuru na ọ chọrọ ị ga otu egwuregwu bọọlụ China agbanyeghị na onyeisi Madrid gwara ya na ọ gaghị ekwe ka ọ pụọ na nkịtị. USA ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Naịjirịa. Otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria emeghi ihe ha mere ndị Qatar na mmepe asọmpị iko Fifa U-20 dịka ha achịtaghị aja n'ebe otu egwuregwu USA nọ ka ha zutere onwe ha ụnyahụ. Ha mechara jiri ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Naịjirịa. Naịjirịa na Ukraine ga-ezute n'ụbọchị tọzdei na-abịanụ. Nkeji taata Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Imo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri '" 45109774,https://www.bbc.com/igbo/45109774,Anambra steeti ga-enyocha ndị ji ya ụgwọ,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a :,"Ipob amapụtakwala ọzọ wegharịa udo nke ohaneze ndi Igbo na ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere. Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ Ha kwuru na ọ bụ maka na ha enweghi ike ịkwụsị mmachi a machiri Ipob dịka otu na-eyi egwu. Naịjirịa Anambara steeti chịkwa ọkụ eso ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na steeti ahụ, ha achọghị ndị anaghị atụ ụtụ isi cha cha. Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Steeti ahụ ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịma akwụkwọ n'akụkụ ebe ọbụla iji chụ nta vootu ga-akwụ ụtụ so ya. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ndị ụlọomeiwu ga-enwe nzụkọ ụbọchị Tuzde n'izu na-abịa maka bọjetị a chọrọ ịgbakwunye na nke 2018. Osote onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Yusuff Lasun kwuru nke a ụnyaahụ ka ndị otu ha nọ na pati APC mesịrị ọgbakọ nke otu PDP kwukwara na ha ga-esonye. Akụkọ mba ofesi Nọt kọrịya abarala Amerịka mba na ha ka na-enye ha ntaramahụhụ maka ngwọagha nuklia ha. Trump na Kim kwesiri ịkparịta ụka n'abalị iri na otu ọnwa Juun na mba Singapore Ha kwuru na ha agaghị akwụsị ime ngwọagha ahụ ma ha jiri ụdị aka ahụ nke ha kwuru na ndị na-eme mkparịtaụka gbasara ya anaghị eso ebumnobi Donald Trump. N'egwuregwu, N'egwuregwu, ndị n'ọchị ndị na akwa dịka e mechiri ohere ịzụrụ ndị ọgba bọọlụ n'asọmpi Premia Lig. Mana ndị ntorobịa ji ọnụ na-eche ya bụ asọmpi ga-amalite taa nke otu egwu bọọlụ Man United na Leicester City ga-ebido. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?" afirika-43497298,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43497298,Ike Ekweremadu 'tụrụ asị ma zo akụnaụba ya',Gọọmenti etiti akpọpụla osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka akpachie ụfọdụ ụlọ ndị o nwere na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.,"Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu Ha kwuru na ọ tụrụ asị n'ikwupụta akụnaụba o nwere nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct tupu o were oche ọchịchị N'ime ụlọ ndị a, itoolu dị na Naịjirịa, asatọ dị na Dubaị, atọ dị na Flọrịda, ebe abụọ dị na Lọndọn. Onyeisi otu nyocha na iweghachi akụnaụba Naijiria nke onyeisiala hiwere bụ Okoi Obono-Obla kwuru na Ekweremadu ekwupụtaghị akụ ya niile n'ime akwụkwọ nkwupụta odere n'ọnwa Juunu nke afọ 2007 nakwa 2015. Ndị otu a site n'ọnụ ọkaiwu Festus Keyamo gwara ụlọikpe na-enyocha Ekweremadu maka ị da iwu ndị Code of coduct nyere ndị nọ n'ọchịchị. Akwụkọ ha degara ụlọikpe kwuru ka-akpachie ụlọ ndị ahụ Ekweremadu nwere rue mgbe ha ga-emecha nyọcha banyere ya. 'Ebubo ndọrọndọrọ ọchịchị' Ekweremadu site n'ọnụ onye ndụmaọdụ ya na mgbasa ozi bụ Uche Anichukwu kwuru na okwuputala akụnaụba ya niile nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct dịka e dere n'iwu. ""Ndị nyocha a jụrụ maka akwụkwọ nkwuputa bụkwanụ nke enyere haa ma ha achọghị ileba ya anya, maka ọ bụ ihe ndọrọndọrọ ọchịọchị nke 2019. Sịnetọ agwala ndị ọkaiwu maka nke a, ha ga-ezute ndị a n'ụlọikpe."" Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mbọ ndị BBC gbara iji nweta ndị otu Ekweremadu na ndị ụlọọrụ Code of conduct enweghị isi, dịka ha azaghị ekwentị ha. Cheta na onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki ka na-azara ọnụ ya ugbua gbasara otu ebubo nkwuputa akụnaụba ahụ. Nke pụtara na ndị isi ọchịchị Sịneti abụọ nọ n'ime ọgbaghara nkwuputa akụnaụba ha." 42775975,https://www.bbc.com/igbo/42775975,Ndị ọrụ gọọmentị Amerịka emechiela ka ọrụ na-ebido,"Ihe ruru narị na puku ndị ọrụ gọọmentị etiti agaghị abịanwu ọrụ na Mọnde, ka ndị Sineti mba Amerịka na-adọlị ịkwụsị mmechi ụlọ ọrụ gọọmentị.","Statue Liberty so na ebe mechiri, mana onye na achị New York na akọwa na ya ga eji ego steeti ya kụọ ndị mmadụ ụgwọ onwa Agaghị akwụ ụfọdụ ụgwọ ruo oge ha ga-enwe mkpebi. Ọgbakọ ndị sineti nwere n'ụbọchị ụka amịtaghị mkpụrụ nkwekọrịta ọbụla n'etiti ndị Democrats na ndị Republicans, ebe mbịarambịara bụ otu n'ime okwu akpụ n'ọnụ. Ọrụ ndị dị oke mkpa ga-narụ mana ọmetụtara ụfọdụ ndị ama-ama dị ka Statue of Liberty. E mechiri ya bụ ihe ncheta akpụrụakpụ n'ụbọchị ụka, mana gọvanọ New York bụ Andrew Cuomo, kwuru sị na ọ ga-etinye aka n'ime akpa ego steeti ya were kwụọ ndị mmadụ ụgwọ ọrụ, ma meghekwaa ya bụ ebe nlegharị anya ama ama. End of Twitter post, 1 Ha nwere ọgbatughie. Gịnị kpatara gọọmentị ji mechie? N'etiti abalị Fraịde, ndị omeiwu ekwenyeghị na iwu nchekwa ego. Iwu ahụ esonyeghi na atụmatụ nke ego 2018 niile, mana ọ gaara-eme ka ihe na-aga ọfụma ruo etiti ọnwa Febrụwarị. Ndị Democrats ekweghị akwụdo na mkpebi nwaoge ha kpebiri, ruo oge emere ihe gbasara ucheobi ha maka ndị mbịarambịara. Mgbalị niile ha gbalịrị iji hụ na ha nwere nkwekọrịta tupu izu ọrụ ọhụrụ eruo, dara na Sunde. Eyigharịrị mbinyeaka iji akwụsị mmechi ọrụ ruo etiti ehihie Mọnde, nke pụtara na ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị etiti agaghị emepe, ga-eme ka mmechi ọrụ a banye ụbọchị atọ. N'okpuru iwu Sineti, iwu a kwesịrị inwete mbinyeaka iri isii n'ime mmadụ otu narị nọ na ụlọiwu ahụ. Trump tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter." afirika-47437856,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47437856,EFCC atọhapụla ọgọ nwoke Atiku ha nwụchiburu,Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ngalaba EFCC atọghapụla ọgọ Atiku nke ha nwụchiri kemgbe ụbọchị satọde gara aga.,"EFCC nke na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego boro ya ebubo na o mefuru ego ruru yuro nde otu narị na iri ise nke Bekee kpọrọ ""Laundering"". Ọnụ na-ekwuchitere EFCC bụ Tony Orilade zipuru ozi a dịka ụlọorụ ntaakụkọ Punch siri kwuo. Ọzọ Ndị ụlọikpe etiti dị n'Abuja na ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC, kwekọrịtara sị ka a kwụsị nyocha a na-eme maka ebubo mmefu ego e boro Alex Badeh bụ onye ọchịagha ndị agha mmiri a gbagburu n'ọnwa Disemba 2018. Mana ụlọikpe ahụ mara Iyalikam Nigeria bụ ụloọrụ Badeh ikpe, ma sị ha nyeghachị gọọmentị etiti akụnaụba niile a kpachiri n'aka ha. Achụọla onyeisi CBN? Isaac Okoroafor bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ ukwu Naịjirịa bụ CBN, ekwuola na achụghị Godwin Emefiele bụ onyeisi ha, n'ọrụ dịka ndị mmadụ si na-ebugharị na soshal midia. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: CBN ekwuola na achụbeghị Emefiele n'ọrụ N'ofesi, Hillary Clinton zọburu ọkwa dịka onyeisiala mba Amerịka, ekwuola na ọ gaghị abịghachị ịzọ ndọrọndọrọ nke afọ 2020. Kama o kwuru na ọ gaghị akwụsị itinye ọnụ ya n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. N'egwuregwu, Otu Super Falcons nke Naịjirịa, ga-ezute mba Thailand echi, ebe ha ga-azọ onye ga-azọta agba ngwụcha nke asaa, dịka ha nwetara pọintị atọ n'ime egwuregwu atọ na Group C n'asọmpi Cyprus Womens' Cup. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Election 2019: Ị ga-atụnyere onye masịrị gị?" afirika-47637297,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47637297,Agriculture:Ọgwụ eji egbu ahịhịa n'ugbo nwere ike ịbute kansa,N'ọnwa Maachi ka ọrụụgbo na-ebiri ọkụ ebe niile n'Alaigbo.,"Onye ọrụugbo Mgbe dị otu a ka mmiri mbu ji atụ n'ala. Oge ahụ ruo, ndị ọrụugbo na-amalite ịbọcha ugbo ha maka ịkọ ubi. Ndị ọrụugbo dị iche iche an eji ụzọ dị iche iche abọcha ahịhịa n'ubi. Ụfọdụ na-eji aka abọcha ala ha, ebe ụfọdụ na-eji ọgwụ na nma na-egbu ahịhịa tupu ha akọọ okwu. Ndí ọrụugbo BBC Igbo gbara otu onye ma nke ekwe na-akụ n'ọrụugbo bụ Chukwunonso Agbo ajụjụ ọnụ ịmata ihe ọ dịka ya iji ogwụ gbuo ahịhịa tupu akọwa ugbo. Agbo sị na "" ụfọdụ n'ime ha dị mma. Iji ọgwụ gbụọ ahịhịa n'ugbo adịghị njọ, mana ọ dị mkpa ịmata ka esi etinye ya n'ọrụ. Nsogbu bụ na-ọtụtụ mmadụ amaghị otu esi etinye ya n'ọrụ. Amaghị ihe a bụ ihe na-ebute nsogbu niile so itinye ọgwụ a n'ugbo"". Kedu uru iji ọgwụ gbuo ahịhịa bara? Ana eji ọgwụ egbu ahịhịa mgbe onye ọrụ ugbo enweghị ike ọ ji abọcha ahịhịa. Onwekwara ike iji ọgwụ mgbe onweghị ego ọ ga-akwụ ndị ọrụ ga-enyere ya aka ịbọcha ahịa n'ugbo. Ọ na-enyekwa aka ka onye ọrụugbo ghara itufu mgbe na ike onye ahụ ga-eji rụpụta ihe. Ndi ọrụugbo Kedu ka esi etinye ọgwụ n'ọrụ ka ọ dị mma? Agbo kwuru na agbanyeghị na ịjị ọgwụ bọchaa ahịhịa dị mma, na ọ dị mkpa ịmata etụ esi etinye ya n'ọrụ. Nke agụnyere ịmata ole ekwesiri itinye n'ala ka ọ ghara imebi ihe. Gee Chukwunonso Agbo ntị n'olu Ọgwụ eji egbu ahịhịa n'ugbo nwere ike ịbute kansa Kedu ihe ga-eme ma ya bụ ọgwụ karịa n'ala? Ọ bụrụ na onye ọrụugbo amaghị ọgwu ga-ezu, ọ karịa ya bụ ọgwụ, ọ nwere ike ịmebi ụmụ nje na enyere ala aka. Nke a ga-eme ka ala ahụ ghara ịmeta nri nke ọma. Mgbe ụfọdụ ọgwụ ahụ karịa ọnwekwara ike ịbanye n'ime nrị akụrụ n'ubi bụ nke nwere ike ibute ọrịa kansa. Akụkọ ga-amasị gị Ihe nkiri ụbọchị taa Childbirth: Lee obodo anaghị ekwe nwaanyị dị ime mụọ nwa" afirika-44319426,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44319426,Ọrịa Kọlera esenyiela isi ọzọ na mpaghara Naịjirịa,Ụfọdụ obodo dị na mpaghara ugwu Naịjrịa jisike agba ọrịa kọlera mgba ebe e kwuru na o gburu mmadụ irị atọ na otu nakwa ihe ruru otu nde mmadụ bu ya kemgbe Febụwarị.,"A na-achọpụta ndị ohuru bu ya n'obodo Borno, Yobe na Adamawa ka ọnụọgụgụ ya na-arị elu n'ụbọchị ole na ole gara aga. N'Adamawa, ihe ruru mmadụ narị anọ na iri asatọ n'abụọ bụ ihe bu orịa a ebe akụkọ na-ekwu na o gbuola mmadụ iri n'atọ rue ugbua. Njem ọrịa a na Yobe steeti bidoro na ngwụcha ọnwa Maachị gburu mmadụ iri n'ise ebe mmadụ narị anọ n'anọ bu ya mgba agụrụ ọnụ n'ụbọchị 21 May. A nụrụ akụkọ ya kemgbe ọnwa Febụwarị n'obodo Kukawa dị na Borno steeti ebe o fere mmadụ iri n'itoolu. Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe kwuru na udu mmiri so n'ihe ofufe ọrịa kọlera a jiri rịa elu. Mana na mbido ọnwa a, ọgbakọ mba ụwa niile akpọrọ UN na Bekee site n'usoro bụ Nigeria Humanitarian Fund' kewapụ nde dọlla abụọ iji kwado ọrụ ị gbochi ofufe ọrịa Kolera na mpaghara ugwu Naịjirịa nwere ike ị gbu puku mmadụ ole na ole. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46028675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46028675,Uwazurike: Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ihe o kwuru maka Biafra,Ụfọdụ ndigbo anabataghị ihe Ralph Uwazurike bụ onye bidoro otu Massob gwara BBC Igbo gbasara ọnọdụ Biafra ugbua.,"Dịka Nnamdi Kanu, Uwazurike gakwara mkpọrọ maka ịchọ nnwereonwe Biafra N'okwu ya, Uwazurike kọwara na ọ ghọtaghị etu ụfọdụ ndị mmadụ si ekwu na ha chọrọ Biafra ebe ọ bụrụla ihe nọ anọ. O kwukwara na ụzọ e si achụ ya bụ nnwereonwe ugbua butere nkwafu ọtụtụ ọbara. Ihe a na ihe ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ahụ kpalitere ọtụtụ okwu n'ọnụ ma ndị kwadoro okwu ya na ndị akwadoghị ya. Ihe a na-ekwu Otu n'ime ndị kwuru uche ha bụ Modestus Ajaero dere na ọ bu nkọgheri ka Uwazurike na akọgheri: Onye ọzọ bụ Anike Sunday kwuru sị ""Nwoke a erego Biafra nara ego ya kamgbe, ọ bụ mma ihu abụọ. Ekene dịrị Chukwu na ndigbo ibem aghọtala nke a, anyị agbaala ya alụkwaghịm."" Theodore Okafor kwuru sị ""Ralph Uwazurike bụ onye ntaji anya. Wepụ anya gị na ọnụ gị n'arụ Nnamdi Kanu. Ị dị ka onye ọgbaa bọọlụ nọ naanị ipiaji ndị ji bọọlụ ụkwụ. Ọ bụ Mazi KANU mere ka aha Biafra pụtawanye ihe. Ọ bụghị ihe Dim Chukwuemeka bu n'obi banyere ime ka nnwereonwe anyị nwee isi ka ị na-emezi. Ọ dịkwa m ka ị merụọla aka gị n'ụzọ ije site n'irikọ nri na ịṅụkọ mmiri gị na ndị anyị che na ha na-emegide anyị."" Nze Antho Anurugwo kwuru ""Nwoke m, ịmaghị ihe ị na-ekwu. Kedụ nke bụ ha nọ n'ime Biafra na-achọ Biafra? Etu ala Biafra dị taa ọ dị gị mma n'obi? Ihe a abụghị Biafra nke anyị na-achọ. Biafra nke anyị na-achọ bụ ebe a ga-enwe ezigbo ndị ọchịchị, ezigbo ụzọ, ọkụ na mmiri mgbe dum, ezigbo ọchịchị onye-kwuo-uche ya, ebe a ga-eme onye ọbụla ka e mere ibe ya. Ị nwaala ike gị inye anyị Biafra ma onweghi isi, hapụ Nnamdi Kanu ka ọ nwaa nke ya."" Ọ pụtara na enweghị onye kwadoro Uwazurike n'okwu ya? Lee ihe ndị ọzọ kwuru ebe a: Lee ihe nkiri ebe Uwazurike na BBC Igbo nwere mkparịtaụka ebe a: Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC Akukọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44235076,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44235076,Akwa mmiri Niger nke abụọ: Kedụ nke bụ eziokwu?,A na-arụ ọru na akwa Naija? Kedu ebe ọrụ ruru ugbua? Ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari malitere ọrụ a ka ọ bụ onye bubu onyeisiala bụ Goodluck Jonathan?,"Ebinyela aka n'akwụkwọ e ji arụ ọrụ a? Ọ bu asị ka ndị ndọrọndọrọ na-asịri ndị Igbo maka ụ akwa mmiri a? Ajụjụ ndị a na ndi ọzọ bụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ banyere akwa mmiri ahu kwesịrị isi Asaba gafee osimiri ruo Ọnịcha. Ajụjụ ndị a mezịri ka ọ dịzị ka a ga-asị na akwa a na-ekwu okwu ya bụ nrọ ka a na-arọ ya. Mana eziokwu dị na ya bụ na ebe a ahazịrị a ga-arụ ya bu ọru dikwa na ihe, ọ dị n'Obosi di na Anambara steeti nakwa Asaba, bu isi obodo Delta steeti. Ị nọrọ n'akwa nke ochie, ị ga-ahụ nke ọhụ a na-ese okwu, mana ihe mere bụ na akwa mmiri abụghị ihe a na-akọ akụkọ maka ya. Nke pụtara na ya kwụrụ, ndị mmadụ ga-agbara ya akaebe. Etu ya bu akụko sịrị bido Onye ọbula na-agba ụzọ Ọnicha (ma ọ na-aga aga, maọbụ ala ala) n'oge a na-eme nnukwu mmeme dịka Ekeresimesi maọbụ Ista ga-ama na akwa mmiri ahụ adịghi aba ụgbọala. Ndị mmadụ na-arahụ n'ụzọ ụfọdụ oge, mana ị nọọte aka n'ahịrị ụgbọla na-akwụ n'ọnụ akwa mmiri ahụ. Nke a mere ndị mmadụ jiri na-eti mkpu na akwa ahụ adịghị mma, ọkachasị maka na ya bụ ụzọ bụ ụzọ e ji aba ala Igbo. Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ọ dị mkpa ịrụ akwa mmiri ọzọ ma kwekwa nkwa na ọ ga-arụ ya. Nkwa abughị ihe ekwere n'ọnụ. Nkwa sitere mgbe ndị agha ka nọ n'ọchịchị rute mgbe Olusegun Obasanjo, bu onye ndịagha nyere ọchịchị, kwukwara na akwa ọzọ ga-adị. Gọọmentị Umaru Musa Yar'adua, bụ onye nọchịrị anya Obasanjo, tinyekwara ya ọnụ. Mana, ọ bụ Goodluck Jonathan malitere ihe dị ka ọrụ n'ebe amapụtara a ga-arụ akwa mmiri a ka ndọrọndọrọ ọchịchi nke 2015 na-ekpo ọkụ. Mgbe Jonathan gara ịhụ Obi Ọnịcha bụ Igwe Wilfred Achebe, ọ gwara ya na ọ ga-arụcha ọru n'akwa mmiri ahụ n'ime ọnwa iri na anọ. Mana mgbe ọchịchị Muhammadu Buhari malitere, ha kwuru na onweghị ihe kwụ ọtọ na ya bụ ọgbọ ọrụ. Ka oge gara, o mere ka ndị mmadụ echefụrụ maka ọrụ akwa, mana okwu ya bidokwara iwu ewu ka ndị ọrụ mgbasa ozi nke soshal midia nke gọọmentị zịpụrụ foto ha kwụrụ na-egosi ọrụ na-aga n'ihu n'akwa mmiri Naịja ke abụọ. Soshal midia nwuru ọkụ ka ọtụtu ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ asị, na onweghị ihe ọbụla na-eme ebe ahụ. Ihe Fashola Kwuru Fashola gara mpaghara ọwụwa anyanwụ ileta ọrụ dị icheiche na-aga n'ihu ebe ahụ Babatunde Fashola bụ Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ gara Anambara ebe a na-earụ akwa mmiri ahụ ileru anya etu ya bụ ọrụ si aga. Fashola gosiri igwe siri ike a na-eli n'ime ala e ji ewuli ya bụ akwa mmiri. N'akụkụ nke ya, onye na-elekọta ọrụ ahụ na-aga n'ihu bụ Patrick dugarịrị Fashola ma kọọwara ya etu ọrụ ahụ si aga. Fashola kwukwara na a na-arụ ọtụtụ ọrụ iji hụụ na a na-eleta ya bụ akwa mmiri anya ma a rụchaa ya. Fashola kwuru na ha ha arụọla ọrụ pasentị 50 itinye pila n'ala ga-ejide ya bụ akwa mmiri mana arụbeghi akwa mmiri ahụ na onwe ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-51510936,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51510936,Manchester City: A machiela ha n'egwuregwu Uefa afọ abụọ,A machiela otu egwuregwu Manchester City maka isonye n'asọmpi nke Yurop n'afọ 2020/21 ruo 2021/22 maka imebi iwu otu jikọrọ otu egwuregwu niile nke Uefa.,"Iwu ndị ahụ gbasara akwụkwọ ikike ha nakwa usoro mkpata na mmefu ego nke ndị otu a. Ọ dị ka nke ahụ ezughị, a daa ha nha ego dị Euro nde iri atọ. Agbanyeghị, ha nwekwara ohere ịga ụlọikpe maka ịzọ isi onwe ha. Manchester City sị na ya bụ ""mkpebi wutere ha mana ọ gbagwojughị ha anya"" ma sịkwa na ha ""ga-aga ụlọikpe maka ya"". Ha kwuru na ""otu ha na-atụkarị anya ịchọta ụzọ kwụọtọ iji leebe anya na usoro ha sị eme ihe."" N'ọnwa Disemba nke 2018 ka onyeisi nyocha nke Uefa nọ n'ọgbọ kwuputa ihe ga-abụ mpụtara nyocha ha na ntaramahụhụ so ya tupu ha ekpebie ya bụ ikpe. Manchester City ekpesebuola otu na-ahụ maka idowe iwu maka aka enwe ha huru na ya bụ ofe gbasara ya bụ ikpe. Ha na-ekwu na ya bụ ikpe nke naani Uefa bụ ekwuchaa ọgwụ akwụghị ọtụ ma ọlị. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51354214,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354214,Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China,"Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha n'ebe ahụ si kwụrụ.","Olu onye Naịjirịa nọ na China na-ekwu maka ihe ha na-agabiga n'ihi Coronavirus Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha. ""Anyị ahụghị gọọmentị anyị anya nke anyị ji nụ ọnụ okwu ha"" ""Nke bụ eziokwu bụ na ị bịa ebe anyị na-akpa nkata n'ekwentị, anyị na-ebe akwa n'ihi na anyị enweghi gọọmentị. Ihe anyị na-anụ bụ na gọọmentị Gana sị na ha ga-ezitere ndị be ha nọ akwụkwọ ebe ahụ Yuan puku iri ka ha jiri na-ego nri. ""Mana o nwebeghi etu anyị siri nụta n'ọnụ gọọmentị anyị. O nwere ndị na-ekwu na gọọmentị sị ka ha dekọta aha ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ na Chaina. Mana ihe anyị chọpụtara bụ na ndị mmadụ ji anyị agbagharị. Nke bụ eziokwu bụ na o nwebeghi ihe gọọmentị Naịjirịa gwara anyị."" N'agbanyeghị ihe Chukwunonye na-ekwu, onyeisi ngalaba na-ahu maka ọdịmma ndị Naịjirịa nọ n'ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa, sị na ha na-agba mbọ maka ndị tọrọ n'obodo Wuhan bụ ebe nje a gbugoro ihe karịrị mmadụ 300 malitere. O dere mbọ ha na-agba n'akara Twitter ya. N'agbanyeghị ihe odoziakụ Dabiri-Erewa dere, Chukwunonye na-ekwusi ike na onweghị onye ha hụrụ. Mana, ọ sịkwa na o nwereike bụrụ makana ọ bụghị na Wuhan ka ya na-agụ akwụkwọ. ""Ọ bụ na Wuhan ka ndị mmadụ tọrọ kpọmkwem. Onye butere ọrịa n'obodo ụlọakwụkwọ anyị dị enwetela ọgwụgwọ."" Ọ sị na n'agbanyeghị nke a, obi adịghị ha mma etu ọ na-enwebeghi ozi ọbụla ha nụtara n'ọnụ ndị na-achị Naijirịa. ""Ọ bụ ndị seputere isi nwereike isị na ha na gọọmentị anyị na-akpa. ""Ọ bụ ihe ihere na obodo dịka Naịjirịa na-ebute Chaịna ego agaghị achọ etu ha na ha ga-esi kwekọrịta mara etu a ga-eji nye aka...ọ bụrụgodi site n'inye ụmụakwụkwọ mkpuchi imi."" ""Etu anyị si biri na Chaịna ugbua"" Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ. ""Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ Quarantine ugbua. ""A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ gaa bute nje ahụ."" Ọ sị na ọ bụrụ na ị ga-apụrịrị ị ga-anata akwụkwọ ga-enye gị ikike ịpụ. ""Ị pụchaa lọta, a ga-enyocha gị ahụ ọfụma ma tinyekwa gị na quarantine bụ ebe ị ga-anọ ruo oge ha jiri hụ na ahụ dị gị mma tupu e kwe ka ị gaa ebe ndị ọzọ nọ."" Ọ sị na tupu ị gagharịa n'ebe ha bi, ị ga-eyiriri mkpuchi imi. ""Etu esi eri nri"" Chukwunonye sị na ụlọakwụkwọ ha haziri ndị ọ bụ ọrụ ha ịpụ gaa gote nri na ihe ndi ọzọ ndụ chọrọ. ""Nrị gị gwụ, i tinye akwụkwọ, ndị a họpụtara agaa gote nri."" Ọ sị na a na-eyichi ndị ahụ ahụ ọfụma tupu ha agawa njem a. ""A na-etinyekwa uche n'ebe ha na-aga na ihe ha na-ego iji hụ na ọ dị mma oriri, na-abụghị nke bu ọrịa."" Mmachi anyị ikwu maka ọrịa coronavirus Chukwunonye sị na ọtụtụ mba abịala bịa buru ndị be ha lawa. Mana, otu ihe o kwuru tụrụ anya bụ na mba Chaịna sị ka ha ghara ikwu maka nje a, ọkachasị ma ọ bụrụ ndị ntaakụkọ na-ajụ ajụjụ. O gosiri ozi e ziteere ha site n'ihe mgbasaozi WeChat, na-akọwa na e nwere ndị ntaakụkọ si mba ofesi na-ajụ ụmụakwụkwọ a ajụjụ maka ihe na-eme na Chaịna. Ozi a gwara ụmụakwụkwọ ka ha cheta na ha ekwesịghị ịsa ajụjụ ndị ntaakụkọ, dịka ọ bụ ndị na-ekwuru ụlọakwụkwọ ka ọ dịrị ịsa ajụjụ ọbụla. Chaịna dị njikere maka nje a Site n'ihe Chukwunonye kwuru, ndị nọ na mba Chaịna nakwa ha bụ ndị bịara abịa, ma ihe ha kwesịrị ịma maka igbochi nje coronavirus ifesa ha. Ọ sịkwa na ihe ọ hụrụ bu na ya bụ mba na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha meriri ya bụ nje. Na Naịjirịa, minista na-ahu maka ahụike bụ Osagie Ehanire, sị na Naịjirịa dị njikere maka nje Coronavirus. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53203334,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53203334,N-Power 2020: Ndị ntoroọbịa amakpuola ọbaozi a ịchọ ọrụ,Ọba ịntanetị ngalaba na-ewe ndị ntoroọbịa n'ọrụ nke nwamgbenta akpọrọ N-Power na-enwu ọkụ dịka puku kwa puku ndị ntoroọbịa malitere idenye aha ha iji soro na ndị nwereike ịnwete ọrụ.,"N-Power bụ atụmatụ gọọmentị Naịjirịa si na ọ chọrọ iji nyere ndi ntorobịa gụchara mahadum aka Nke a na-abịa dịka N-Powere tiri mkpu na ụfọdụ mmadụ malitere idenye aha tupu ha emepee ụzọ. N-Power dọrọ ndị ntoroọbịa aka na ntị na anaghị akwụ ụgwọ iji denye aha n'atụmatụ a. End of Twitter post, 1 Ọ bụ ka oji nkeji 45 gafee elekere 11 nke ụtụtụ n'ụbọchị Fraịde bụ Juun 26 ka ọba ndenye aha a mepere. Ndị niile denyere aha tupu oge a ga-emegharị ya maka N-Power sị na ha anabataghị nke mbụ ha mere. Ka ọ kwụ ugbua, ụmụ ntoroọbịa na-edenye aha aghara aghara, dịka ha na-egosi n'akara Twitter ha. Mana dịka ụfọdụ na-ekwu na ha gafere njem idenye aha ha ọfụma, onwere ndị sị na ụkwụ kpọrọ ha n'ụzọ. Ngalaba N-Power, site n'akara Twitter ha na-akọwa ma na adụ ọdụ etu ndị a ụkwụ kpọrọ ga-esi chọta ezigbote ụzọ ha ga-esi edenye aha ha. Etu ndenye aha na N-Power a si ewu gosiri na ọtụtụ ntoroọbịa Naịjirịa chọrọ ịnwete ọrụ, nke gbara akaebe akụkọ na-ekwu na ndị gụchara mahadum enweghi ọrụ ka nkụ. Ọ gịnị bụ N-Power? Onyeisiala Muhammadu Buhari hibere N-Power n'afọ 2016 iji belata ụkpa na ụbịam, enweghị ọrụ nakwa nsogbu na-eso ha. Atụmatụ a gunyere iwe puku kwa puku ndị enweghị ọrụ ma zinye ha ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ ndị ọzọ ebe ha ga-arụ ọrụ. Gọọmentị na-akwụ ndị a puku naịra iri atọ kwa ọnwa n'ime atụmatụ a. Ogige gọọmentị atụmatụ a dabara bụ nke akpọrọ ""Social Investment Programme"". A na-ele anya na ọ bụ ndị ntoroọbịa 400,000 ka a ga-enye ọrụ n'ọkpọ a. Etu esi edenye aha na N-Power nke 2020 Ndị so na ọkpọ a akpọrọ ""Batch C"" ga-edenye aha ha n'ọba . Ndị tozuru isonye n'ihe a bụ ndị di afọ 18 ruo 35. N-Power kọwara etu esi eme ya na foto a. Etu ị ga-esi denye aha na N-Power Lee ihe onye chọrọ idenye aha kwesiri inwe Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo nọ n'isi ndị na-ahụ maka akụnauba Naịjirịa Njirimara gọọmentị nabatara: Ndị N-Power na-achọ Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ mmadụ 400,000 ka ha na-ele anya ịwe n'ọrụ na mpaghara dị iche iche gunyere ịkụzị nkụzi, ịrụ na ngalaba ọrụ ugbo, ịrụ na ngalaba na-ehibe ụlọ, ịrụ na mpaghara nka nakwa teknụzụ. Kemgbe amalitere atụmatụ a na 2016, ndị gaferela na ya eruola 500,000." afirika-46748872,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46748872,Ihe asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka,"'Ọrịa abụghị naanị ihe na-emetụta ahụ anyị, e nwere ọrịa na-emetụta uche.","Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka Mmadu ida mba n'obi na-abụkarị ihe na-akpata ikwụ ụdọ. Nke a bụ ọnụ okwu ọkachamara n'ihe gbasara ahụ ike nke uche bụ Pamela Udoka. O kwukwara na ọ dị mkpa ịleba anya na ụfọdụ ihe nwere ike ime ka mmadụ gbuo onwe ya. Udoka gwara BBC Igbo ụzọ dị iche iche a ga-esi mara onye nwere ike ikwụ ụdọ, nakwa etu a ga-esi nyere ya aka. Mmadụ ịgbanwe akparamagwa ya na mberede Ehighị ụra maọbụ ihi oke ụra Irife nri oke maọbụ ịkwụ agụụ Adịghịzị enwe mmasị n'ihe omume ndị na-akpalịbu mmasi gị Onye enweghị ihe ọma ọ na-ahụ n'ọnọdụ ọbụla Mmadụ ịnọkata chọba ịnọ naani ya oge niile Ịkwa akwa n'enweghị ihe na-eti ya I nwere ike ịhụ otu n'ime ihe ndi a maọbụ ha niile. Mana ka o sina dị, ṅaa ntị, na-elenyere nwanne gị anya. Mgbe ị hụrụ ka mmadụ na-eme ihe ndị a, gaa onye ahụ nso, jiri okwu ọma were kasie ya obi. Gwa ya na ihe ọma dikwanụ n'ụwa, ma gbaa ya ume ka o nwee ike gaa ụlọọgwụ hụ onye na-ahụ maka ahụike nke uche, n'ihi na naanị otu ụzọ ka a ga esi gwọọ ọrịa nke uche a. Ọ bụ ma achọpụta ihe kpatara ịda mba n'obi, nke na-ebute ịkwụ ụdọ ka dọkịnta ga-esi were mara ngwọta ya. Ịda mba n'obi nwere ike ime onye ọbụla, ya bụ na ị gaghị akọtọ onye ọ na-emetụta. Kama were obioma kwalite ọnọdụ uche onye ahụ. Akụkọ ga-amasị gi:" afirika-49905846,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49905846,Queens College Yaba: Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ ha ọzọ?,Ọtụtụ ụmụakwụkwọ esila n'ụlọakwụkwọ obibi na Queens College Yaba laa bee ha ịnata ọgwụgwụ maka ọrịa.,"Ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n'ụlọakwụkwo a n'afọ 2017 Ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche enyela ọnụọgụgụ ndị lara site na 700 rue 1000 mana amabeghị nke bụ eziokwu. Otu nne nwere nwa n'ụlọakwụkọ ahụ achọghị ka enye aha ya kwuru na ụmụ ya ka nọ n'ụlọakwụkwọ ""Ụmụ m na-eme ọfụma, onye na-elekọta ha gwara m ya n'ekwentị"" ka o kwuru. Ọ gwakwara BBC Igbo na ọ nụrụ na ọtụtụ ụmụakwụkwọ agbalaala bee ha n'ihi ọrịa amaghị aha ya. Otu onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ na-agbalị ịchọpụta nke bụ eziokwu maka okwu a. Cheta na ụmụakwụkwọ atọ nwụrụ n'afọ 2017 na Queens College maka mmiri ọjọọ ha ṅụrụ. Ọtụtụ nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ kwetere na n'ezie na ọrịa amaghị aha ya bụ nke metụtere ọtụtụ ụmụakwụkwọ batara ya bụ ụlọakwụkwọ. Otu nwoke aha ya bụ Damian kwetere na ya bụ ọrịa metutere nwa ya mana ọ gbakeela. Ụmụakwụkwọ gbakelara lọtara ụlọakwụkwọ Damian sị "" ndị ụlọakwụkwọ ahụ kpọrọ m ka m bịa buru nwa m maka na ahụ adịghị ya. Mgbe m ruru ebe ahụ, ahụrụ ọtụtụ ụmụaka na gbagharị anata ikike ịla ulo"". Ọ sị na-agwọro nwa ya ọrịa ịba na nje n'ụlọọgwụ mana ọ gbakeela ugbua. Damain sị ""nwa m agbakeela ịlahachị ụlọakwụkwọ mana ha sị ka ọ ṅụchaa ọgwụ ya tupu ọ lahachi"". Nne na nna ụmụaka ụfọdụ sị na ọrịa batara na ya bụ ụlọakwụkwọ ebe ụfọdụ na-agbagha ya. Nke a mechere ka akụkọ pụtara na ọbaozi na ụbọchị Tuzde na ọrịa amaghị aha ya batara na ya bụ ụlọakwụkwọ nke metutara tụtụ ụmụakwụkwọ. Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Legọs steeti sị na ha na-etinye anya na ụlọakwụkwọ ahụ na ndị ọzọ ka ha mata ebe ya bụ mmiri sị banye opi ụgbọghụrụ. Gọọmenti kwetere na n'ezie na ihe ruru mmadụ 89 anatala ọgwụgwọ maka ọrịa gbasara ekumume n'obere ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ. Onye ntaakụkọ BBC jikwa anya ya abụọ hụ ndị ọrụahụike steeti bịara ịme nyocha ebe ahụ. Mgbe ndị ọrụ anyị gara ebe ahụ, ndị ụlọakwụkwọ ahụ ekweghị ka ha banye n'ụlọakwụkwọ ahụ maọbụ zaa ajụjụ ọbụla kama ha huru ụmụakwụkwọ ndị gbakerela n'ọrụ bụ ndị laghachitere ụlọakwụkwọ ahụ. Ndị ọrụahụike steeti bịara nnyocha Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43082884,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43082884,Ntorobia na-azọpụta ụmụaka bi n'ezi na Naịjirịa,"N'akwụkwọ ozi anyị sị n'aka ndị ntaakụkọ mba Afrika, ode akwụkwọ Adaobi Tricia Nwaubani nyochara ka otu ntorobia sị azọpụta ụmụaka bi n'ezi.","Ọtụtụ ndị bi n'ezi bụ ndị gbara ọsọ ndụ James Okina anaghị ezobe ihe njọ niile, mgbe ọ bụrụ ụmụaka: ohi; ohị n'ụlọ ahịa. ""Aka m ba n'ọtụtụ ihe ọjọ,"" o kwuru. Okwu nke a bụ nkwuputa njọ na-atụ na-anya. Nke a bụ maka Okina bụ onye ntorobia. Mana ọ na-enye ekele maka afọ nke a bụ afọ nke atọ o bidoro ị zọpụta ọtụtụ ụmụaka bi'ezi na Calabar n'ime Cross River steeti. O kwuru na o bido omume nke a maka: Onye mbu bụ nwannaya, onye nke abụọ bụ otu oberenwa dị afọ iri na atọ ọ hụrụ n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ n'afọ ọ gụchasị akwụkwọ sekọndarị. 'Ọtụtụ ihe m kwesịrị ime' Aha obere nwa nke a bụ Fredrick, o so kwa na ọtụtụ narị umuaka bi n'ezi na Calabar. Ọtụtụ n'ime ha si Bakassi gbaa ọsọ ndụ gbaba agbataobi ha bụ Cameroon. Ezinaụlọ di icheiche achụọla ndị ha bo ebubo amusu. Mana Frederick nwere ezinaụlọ nke ha. Ya na mma ya bi na-otu ime ụlọ. Mana mma ya ahapuola ya. Ugbu a, ọ bụrụ ya na-enye onwe ya nrị. James bụ na agwụ maka nlekọta akụnauba na mahadum nke Calabar Dịka ụmụaka ndị ọzọ bị n'ezi, Frederick na enyi ha bụ Kelvin na-arịọ arịrịọ ego. Okina bidoro i hụ ha abụọ na-enyekwa ha nrị. ""Enyi mmu na ha bụ maka mkparịta ụka anyị, ọ bụghị maka ego ma ọ bụ nrị,"" Okina kwuru. Mana Okina enweghị ọtụtụ ego. N'oge ahụ, ọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ọrụ maka ejiji. Mana olileanya ha bụ ị bụrụ onye ga-enwe ụlọ ọrụ nke ha."" Mana ọ mara na ndị ụmụaka a chọrọ nyemaaka. Maka ihe a, ya na otu nwoke akpọrọ Inyang Edem kwetakwa na ya ga-akwụ ụgwọ ụlọ akwụkwọ Frederick na Kelvin. 'Ekwesịghị ị che ka e chịeghị ọchịchị' Oge ahụ ka Okina nwere mkpebi ị nye ụmụaka a nyemaka. Oge ahụ ka o bidoro Street Priests Inc. ""Mgbe ndị mmadụ na-ajụ gọọmentị ajụjụ maka ọchịchị ha, ị ga-achọ ị me nyemaka ike gị. ""Ekwesịghị ị che ka e chịeghị ọchịchị, ihe a mere eji akpọ anyi Street Priests,"" ọ kọwara. Iyang Edem (r) nyere James Okina (l) aka kuo ụgwọ akwụkwọ ụmụaka a Okini jịrị Facebook na ụzọ ndị ọzọ chọpụta ego maka ịkwụ ugwọ akwụkwọ ụmụaka ruru iri ise. Ọ ka na-aga kwa ile ta umuaka bi n'ezị na Calabar. Ke mgbe, ụmụaka niile mara onye Okini bụrụ. Oge ọbụla a hụrụ ya, umuaka hụrụ ha na agbasa ike ga makụọ ya. 'Obi esighi ha ike' Afọ atọ agafeela, Okina bụ nwata akwụkwọ na-agụ akwụkwọ maka nlekọta akụnauba na mahadum nke Calabar. Okini dị afọ iri na asatọ rịọ egọ ị kwu ugwọ akwụkwọ ụmụaka ruru 215. Ndị ọrụ ya ruru 50. James bidoro nyemaka ya mgbe o ruru afọ iri na ise ""Enweghị m echiche ị chọ ọrụ, mana aga m e ji omume nke a wulị aka ọrụ m."" Street Priests ahụọla ihe sịrị ezigbo ike. Dika otu n'ime ha achọrọ ị gbu makana ozuru ohi. Ọzọ jịkwa ike gbanashị ọnwụ makana ọ ṅụ ọgwụike. Ndị atọ ọzọ nwụrụ maka otu oshịshị eletrik dakwashịrị ha. Onwe otu nwoke gbanahụ ndị ogbu arụ ọbara. A jiri mma gbuka ha ihu. ""Otụtụ mmadụ kwụrụ na ndị umuaka bi n'ezi jiri obi ike, mana mmu wa kwuru na ihe a abụghị eziokwu,"" Okina kwuru. ""Ihe a mere ndị na-ebi n'ezi jiri si obi ike makana ha hụrụ ka ha sịrị gbu enyi ha. Ha kwuru na uwa ebughị ha n'uche."" Okina mara ihe putara na-onweghị ihe gbasara ya na-emetuta. Adaobi Tricia Nwaubani ""Ndụ ya dịbụ mma tụgharịrị oge ọ dị afọ asatọ ka nne na nna ya gbara onwe ha alụkwaghị m"" Ndụ nke ya mmere mmebi n'oge o ruru afọ asatọ. Nne ya hapụrụ ya. Ugbua ka ọ jị ndị ajọ enyi mere enyi. Ọ dara n'ụlọ akwụkwọ, bido kwa i zu ohi. ""Uwa anaghị egbu oge ị nye gi ajọ aha. Ọtụtụ mmadụ anaghị achọ onye ga-agwa ha na ihe a na-eme dị njọ."" 'Akwa mmịrị' Mana nyemaka Okina di nso. Nwa nna ya bi na Lagos kpanitere mmụọ ya. ""O nyere ndị ntorobịa n'akwụkwọ sekọndarị na ụlọ ndị agha akwụkwọ di icheiche. Omume nke a bụ ihe kpalitere m n'obi."" James nwere echiche na Street Priests ga-aga n'iru Oge ya na nwanna ya nwere mkparita uka, Okina nwere nchekwa na ya ga-enwe nchegharị. Ọ bidoro itinye uchu n'akwụkwọ ya, n'oge na-adịghị anya ọ laghachịrị n'ịbụ onye nke mbụ na klaasị ya. ""Ọtụtụ ndị na-eso ndị Street Priests arụ ọrụ bụ ndị ụmụakwụkwọ ibe m mara ka omume m sịrị dị n'oge garaaga, ha hụrụ nchegharị nke m. Ha na-enye aka n'ikpanite mmụọ umuaka ndị a."" Nne ya sokwa na ndị na-enye aka n'ọrụ nke a na nkwuzi asụsụ bekee. Nna ya nwuru n'afọ garaaga. Ugbu a, Street Priests na-enye ndị bi na ogige ndị gbara ọsọ ndụ bi nyemaka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ikike nwatakịrị kwesịrị ime so kwa na nyemaka ha na-enye. Nke bụ nke kachasị ọrụ makana ọtụtụ mmadụ anaghị ekwe enyepụ ebe mgbakọta makana mmemme nke a gbasara ndị ụmụaka bi n'ezi. ""Echiche m bụ ị nweta ebe a ga akpọ nke anyị,"" o kwuru. N'ọnwa Dezemba n'afọ 2017, Street Priests mere mmemme ị kele ndị n'arụlụ ha ọrụ. Edem, bụrụkwa onye nyere Okina ego ugwụọ akwụkwọ nke Frederick na Kelvin, nara ekele puruiche, o bere akwa aṅụrị. ""Oge niile o nyere m ego, ọmaghị na ihe ọhụrụ ka o bidoro n'uwa taa,"" Okina kwuru." afirika-44231145,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44231145,Ọkaiwu: Iwu akwadoghi ikpe mmadụ ikpe n'azụ,Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla mkpebi Ọkaikpe Okon Abang n'ịga n'ihu ikpe odeakwụkwọ otu PDP bụ Olisa Metuh ikpe n'azụ.,"Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ Cheta na Olisa Metuh dara n'ụlọikpe dịka ọ na-azara ọnụ ya maka ebubo mpụ ego dị nde narị naịra anọ n'ọma, nke a mere i ji buru ya gawa ụlọọgwụ. Mana onye ọkaikpe Okon Abang ji ikpe kwuru na ịkpe a ga-aga n'ihu ma Metuh ọ nọ ya ma ọ nọghị ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na naịjirịa katọrọ Okon Abang maka mkpebi a site n'akara twitter ha dị icheiche. End of Twitter post, 1 Ebe ndị ọzọ kwuru na onweghi ọrịa na-arịa Olisa Metuh na ọ kpachara anya daa n'ụlọ ikpe. Mgbe BBC igbo gbara onye ọkaiwu bụ Chijioke Agbo ajụjụọnụ n'ekwentị maka nke a, o kwuru na Naịjirịa kwadoro ka e nye mmadụ ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe. O kwuru na ọ bụrụ na ahụ adịghị onye ahụ ike, na a ga-enye ya ohere ịgbake n'ute ọrịa tupu ikpe ahụ a gaa n'ihu. Agbo kwuru na mkpebi ọkaikpe Okon Abang ezighi ezi dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa jiri kwuo. Gere okwu ya ebe a; Ọnye ọbụla nwere ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-49316330,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49316330,Sam Okwaraji: Ihe agaghi eji chefuo nwaafọ a,Taa ka o mere afọ iri atọ na otu (31) ọkwụrụ aka ndị Igbo nwere n'egwu bọọlụ bụ Sam ọkwaraji dara n'ọgbọ egwuregwu nwụọ.,"Ọ gụrụ akwụkwọ dịka ọkaiwu ma nwekwaa nke Bekee kpọrọ ""Masters"" n'ime agụmakwụkwọ ndị ọkaiwu Ụbọchi 12 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1989 bụ oge Sam Okwaraji gara ọgụ ikpeazụ ya. Ọgụ Okwaraji abụghị nke e ji mma na egbe alụ, ọ bụ n'ama egwuregwu, mana e ji uwe egwuregwu Naịjirịa lụọ ya. N'ụbọchị ahụ Okwaraji dara, ọ fọrọ naanị nkeji 30 ka a gbachaa bọọlụ ahụ Super Eagles na Angola na-agba iji ahọpụta ndị ga-aga Iko Mbaụwa nke afọ 1990. E buru ya gawa ụlọọgwu ebe ndị dọkịnta sị na ọ nwụọla. Ihe Okwaraji ji bụrụ ọpụrụiche N'ime foto a ndị NFF tinyere na Twitter, Okwaraji bu onye nke atọ site n'aka nri na ndị tukwu ala Ndị amaghị maka ya nwereike na-asị na ọ bụ sọsọ ọgba bọọlụ mana ọ bụ sọsọ ihe ọ na-eme n'ama egwuregwu ka e ji mara nwaamadị a? A mụrụ Okwaraji n'ụbọchị 19 nke ọnwa Mee 1964 n'Owere-Umudioka dị n'okpuruọchịchị Orlu dị n'Imo steeti. Ebe ọtụtụ ndi na-agba bọọlụ adịghị abụ ndị na-agụsi akwụkwọ ike, Okwaraji ji asambodo ọkammụta n'ihe banyere ịbụ ọkaiwu. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum dị n'obodo Rome dị na mba Itali. A ma ya ka onye hụrụ mba ya n'anya ọfụma, nke mere ọtụtụ oge ọ na-agbara onwe ya ụgbọ gaa ebe ọ ga gbara Naịjirịa bọọlụ. Okwaraji gbaara Naijirịa bọọlụ ugboro asatọ ma nye otu goolu. Mgbe otu egwuregwu bọọlụ ọ na-agbara bọọlụ mgbe ahụ sị na ọ gaghị agara Naịjirịa asọmpi, Okwaraji sara ha okwu mere ọtụtụ mmadụ jiri kpupuru ya okpu. Ọ sị; ""Abụ m ọkaiwu. Dịka unu ma, ebinyere m aka ịgbara unu bọọlụ, mana echeghị m na ọ ga-egbochiri m ịza oku obodo m. Unu agaghị akwụsị m ịgbara mba m bọọlụ. Ka m gwa gị, aga m aza oku mba m ma unu achọrọ ya, ma unu achọghị ya."" Na nkwanyeugwu, gọọmentị Legọs hibere nka Okwaraji n'afọ 2011 n'ama egwuregwu ebe ọ nọ lụọ ọgụ ikpeazụ ya; National Stadium nke dị na Surulere. Aka chịburu Imo Steeti bụ Achike Udenwa, gụkwara ama egwuregwu dị n'Orlu, Imo steeti bụ obodo o si, aha Okwaraji iji cheta ya. Ndị egwu jikwa aha ya gụọ egwu. Ihe gburu ya bụ ọrịa obi. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-46465174,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46465174,Aisha Buhari: Ugboro ano nwunye onyeisiala tiri mkpu n'ọha,Ndị mmadụ amarala nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ka onye adịghị atụ okwu ụjọ.,"Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ya metụ ọrịakụ Buhari n'obi, o kwupụta ya. Nke na-ewu ugbua bụ okwu o kwuru n' ụbọchị anọ nke ọnwa Decemba 2018 na nzukọ a kpọrọ 'National Women Leadership Summit e mere n'Abuja. Nwunye onyeisiala sị na agbanyeghị na ọ bụ nde kwuru nde mmadu tụnyere Buhari na ntuliaka nke 2015, ọ bụ naanị mmadụ abụọ maọbụ ji ọgbataụhịe gọọmentị ya. Okwu ya a nwuru ọkụ na soshal midia. Ụtụtụ mmadụ na-ajụzị ndị bụ ndị a Aisha Buhari kpọrọ aha. N'ọnwa Ọktoba nke 2017, nwunye onyeisiala bara onyeisi ụlọọgwụ di n'obi onyeisiala bụ Husian Munir mba maka etu ụlọọgwụ ahu dị. Dịka nke a mere ọhụrụ, ọ bu kwa n'ọha ka Oriakụ Buhari kwuru okwu a. Okwu ọzọ Aisha Buhari kwuru dara ụda ọfụma bụ mgbe ya na BBC mere mkparịtaụka n'afọ 2016. Na ya bụ mkparịtaụka, Aisha kwuru na site otu ihe dị, na ya agaghi ikwado di ya. ""If it continues like this, I'm not going to be part of any [re-election] movement,"" says Aisha Buhari Okwu tara akpụ, nke mere Buhari na onwe ya jiri tinye ya ọnụ mge ya na onyeisiala Jamani bụ Angela Merkel nwere nzukọ n'afọ ahụ. Nigeria President Muhammadu Buhari makes his controversial comments Mgbe ahu ka Buhari si na nwunye bu onye isi ekwu. 4) Ka APC mechara ntuliaka imeulo ha, Aisha Buhari gara n'akara ya na Twitter ba ezigbote mba maka etu ha bu ntuliaka siri ga. Ndị mmadụ sị na o bu makana nwanne ya nwoke enweteghị ọkọrọto iji zụọ ọchịchị gọvanọ Adamawa n'okpuru APC. Nke bụ eziokwu bu na enwebeghi nwunye onyeisiala Naịjirịa na-aputa ekwu okwu banyere ọchịchị di ya n'ọzọ a. Aisha pụrụiche." 51741096,https://www.bbc.com/igbo/51741096,"Arochukwu myths, legends: Ihe asaa e ji mara ndị Arochukwu",Arochukwu so na nnukwu obodo dị n'Abịa steeti e jikwa 'Aro okeigbo' mara.,"Ndị Arochukwu bụ ndị eji omenala mara Ha bụ obodo a na-anụ aha ha n'ihi ihe gbasara azụmahịa na mmepe obodo mana ihe e jiri marakachasị Arochukwu bụ omenala. Lee ihe ndị kara aka e ji mara ndị Arochukwu dịka ụmụafọ ha abụọ bụ Linus Nwagbara nakwa Zubi Okafor siri kọwaa: 1. Ibini Ụkpabi O nwere ike ọ bụrụ na ịnụla maka 'Long Juju' nke Arọchukwu oge ị na-agụ akwụkwọ Praịmari maọbụ sekọndrị. 'Long juju' bụ ihe Bekee kpọrọ alụsị ndị Arochukwu nke ezigbo aha ya bụ Ibini Ụkpabi. Arụsị a bụ ebe ndị nwere ikpe banyere ebubo igbu mmadụ, inye nsi, ịta amusu maọbụ esemokwu ezinaụlọ maọbụ obodo na-ebuga ikpe ha. 2. Agha Aro na Briten Ancient wars: Lee ụfọdụ agha Igbo gbara ike na ya Ndị Aro bụ dike n'ịlụ ọgụ n'oge gboo. Ha na ndị mba Briten chịpụrụ ya na ọgụ ha lụrụ abalị anọ bụ nke a maara dịka 'Anglo-Aro war'. Ndị Briten buru agha ahụ n'ihi na ha na-ahụta ndị Arọ dịka ndị na-awụnyere ha aja na garị na mbọ ha na-agba iweghara ala Igbo bụ ebe ndị Aro ji ọgbọ dịka ndị 'na-ahụ ụzọ.' 3. Igba ohu Ndị Arọ bụ ndị a mara ama n'ịgba ohu mgbe gboo. E kpee mmadụ n'Ibini ụkpabi, ikpe ma onye ahụ, ọnwụ bụ ihe so ya . Mana oge e bidoro ahịa ohu, ndị Arochukwu na-ere onye ikpe mara resị ndị ọcha kama igbu ya egbu. Akụkọ mgbe gboo kọrọ maka otu oke mmadụ aha ya bụ Omenụkọ onye ji ịgba ohu baa oke ọgaranya. 4. Ihibe arụsị Ọ bụghị naanị na ndị Arochukwu nwere Ibini-Ukpabi, ha na-aga enyere obodo ndị ọzọ aka ihibe arụsị n'obodo ha. 5. Arondiuzogu, Ajali, Ohafia na ndị ọzọ ha na ndị Arọchukwu bụ nwanne E wezuga omenala, ihe ọzọ e jiri mara ndị Arochukwu bụ azụmahịa. Ndị Arochukwu bụ ndị na-agba mbọ ma na-eme njem azụmaahịa gaa obodo dị iche iche n'ala Igbo na mba ndị ọzọ. Lee emume iri ji ndị Arochukwu Ọtụtụ mgbe, ha gaa mba ọzọ, ha nọrọ ebe ahụ were ebe ahụ mere be, lụọ nwaanyị ma mụbaa. Ugbua, e nwere ndị Arọ n' Arondiizuọgụ, Ajali (Anambra Steeti), Uzuakoli (Abia), Arongwa ( Abia steeti), Afikpo(Ebonyi steeti) wdg. Ọtụtụ ụmụnne ndị arọchukwu na-ezụkọ n'igwe kwa afọ maka 'Mass return' n'emume ikeji. 6. Ndị Aro nwere mmadụ Ndị Arochukwu nwere ndị aha ha na-ada ụda n'Igbo nakwa n'akụkụ ụwa niile. N'ezie, Arọchukwu so na 'ndị nwe obodo enwe' ma ọ bụrụ otiegwu a ma ama bụ Oliver de Coque. Ha gụnyere Alvan Ikokwu bụ onye nkuzi nwere agba, Ọkammụta James Ijoma, Nwakanma Okoro, Alex Onye Ado, Alex Otti wdg. 7. Igbu ejima Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị? N'oge gboo, ndị Arochukwu na-atụba ụmụ ejima na nne mụrụ ha n'ajọ ọhịa n'ihi nkwenye na ejima na-ebute ihu ọjọọ. Mana Linus Nwagba kọwara na ""Mary Slessor na-atụtụta ụmụaka ndị ahụ na-elekọta ha"". ""Ọbịbịa ụka Kraist mere ka ndị Arọ kwụsị ya bụ omenala nke mere na ugbua ejima juru n'ọtụtụ ezinaụlọ."" Traditional Retirement:'Ịgba Ọtaọmụ bụ ihe anyị emepe obodo' - Ndị Amaekpu Ohafia Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'" afirika-53926705,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53926705,Nchekwa n'Alaigbo: Gịnị na-eme na kọmitii nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ?,Ndị nọ na kọmitii nchekwa nke ala Igbo ekwuola ihe n'eme na ya bụ ime mkporo.,"Nchekwa n'Alaigbo: Gịnị na-eme na kọmitii nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ? Okammụta Uzodinma nke Alaigbo Development Foundation(ADF) bụ onye otu ya bụ kọmitii ya na onyeisioche ya bụ kọmiti bụ Ọchịagha Obi Umahi (lagoro ezumike) kọwara ọnọdụ ya bụ kọmitii ugbua. Ndị nọ na kọmitii nchekwa nke ala Igbo ekwuola ihe n'eme na ya bụ ime mkporo. Okammụta Uzodinma nke Alaigbo Development Foundation(ADF) bụ onye otu ya bụ kọmitii ya na onyeisioche ya bụ kọmiti bụ Ọchịagha Obi Umahi (lagoro ezumike) kọwara ọnọdụ ya bụ kọmitii ugbua. Gee Maxwell Ozoaka ntị n'olu Otu onye kọmitii nchekwa n'ala Igbo ekwuola nke na-eme N'izu gara aga ka Nwali sị na ya bụ Kọmitii pụọ sị na ya arụjuola maka ọbụghịzị ihe ekwe na-akụ ka ha agba, Obi Umahi n'onwe ya sị na ọnweghị ebe Nwali gara maka na kọmitii o so na ya bụ ""adhoc"" kọmitii rụchagoro ọrụ ha gbasaa. Mana onye ọzọ bụkwa onye otu ya bụ kọmitii bụ Maxwell Ozoaka bụ onye ọkaikpe na-akọwa na ya bụ kọmitii abụghị ""adhoc' kama na ọ bụ ""expanded nakwa standing"". Sụpịrị sụpịrị a pụtara na ya bụ kọmiti arụchabeghị ọrụ ha kama na ha na-eche ka ndị gọvanọ nye ha ntuziaka gbasara akwụkwọ ha zigara ha. Ọ na-akọwa na ya bụ kọmitii enweghi ike ịrụcha ma ha agwaghị ndị Igbo ihe ha rụpụtara. Maxwell kwara arịrị na ndị Gọvanọ Alaigbo anaghị eme ihe ndị mmadụ chọrọ, kama na ha na-eme ihe dị ha mma. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị na "" ị hapụ ọrụ chukwu sị gị rụwa, na ị ga-aza Chukwu ajụjụ"". Ozoaka sị ọ bụ maka udi mgbawa obi ha na-enwete n'aka ndị isiọchịchị ala Igbo ka ya na ọnwe ya jikwa gbaa arụkwaghị m n ayu bụ kọmitii. Ndị na-achị Alaigbo ejighị ihe anyị na-ekwu maka nchekwa Alaigbo mee ihe Ọkammụta Uzodinma Nwala bụ onyeisi Alaigbo Development Foundation akọwala ihe mere o ji gbaa rụkwaghịm dịka otu n'ime ndị kọmitii e hiwere maka nchekwa ala Igbo. Ọ sị na ihe mere o ji mee nke a bụ na ndị gọvanọ ala Igbo ejighi ihe kọmitii a wepụtara maka nchekwa ala Igbo kpọrọ ihe. Nwala sị na ihe e jiri hiwe komitii ha bụ ka ha wepụta usoro nchekwa zuru ala Igbo ọnụ dịka nke dị Yoruba bụ ""Amotekun"", bụ nke ha gbara mbọ depụtara usoro ndị a site n'enyemaka ndị obodo, ndị ụka nakwa ndị isi ọdịnala dị iche iche. Mana ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ bịaziri kwuo na ihe ha chọrọ bụ uweojii obodo a kpọrọ 'Community Policing'. Kwuo ka Steetị ọbụla hiwe nchekwa nke ha. Na ndị gọvanọ a ji ụkwụ zọchie akwụkwọ niile kọmitii ha dere banyere usoro a ga-eji hiwe nchekwa zuru ala Igbo ọnụ. Nwala sị na nke a megidere ihe bụ isi isekpu ntị e ji hiwe ha dịka kọmitii nchekwa ala Igbo na ọ bụ ya mere o ji gbaa arụkwaghịm. Nke a pụtara na nwa ha bịara iku dịka kọmitii e hiwere maka nchekwa ala Igbo anwụọla. Ihe ndị ọzọ ọ kpakwasịrị ụkwụ gụnyere etu ndị ọchị ehi si awakpo ọtụtụ obodo dị n'ala Igbo na e nweghi ihe ọbụla a na-eme ha. Na ndị ọchị ehi a ehiwechala ebe obibi dị iche iche n'ime obodo ndị dị n'ala Igbo Ọzọkwa bụ ihe mere n'Emene Enugwu Steetị bụ ebe ndị nchekwa na ndị otu Ipob kwasuru onwe ha nke e gburu ụfọdụ mmadụ gụnyere ndị Ipob na ndị nckekwa. Nwala nyere ndụmọdụ sị ka ụmụafọ Igbo jụọ ndị ọchịchị a ọkachasị ndị gọvanọ ese maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-46444739,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46444739,Okorocha: Uche nwosu awụfeela n'otu ndọrọndọrọ ọzọ,Akụkọ n'ewuewu bụ na Uche Nwosu a hapụla pati APC banye otu Action Alliance (AA).,"Onye dị nso n'ebe Uche Nwosu na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ hapụru APC gawa zie AA, ọ gwara ọha etu a mgbe o rituru ụgbọelu sị Abuja lọta. Okwu Uche Nwosu O kwuru na o mere nke a n'ihi ịhụnanya o nwere n'ebe Imo steeti nọ karịa ndị ntoroọbịa ya. Onye a gaa n'ihu kwuo na Uche Nwosu ga-akwado Buhari n'ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2019. Ọnụ na-ekwuchitere ndị APC n'Imo steeti agbasola Uche Nwosu N'aka ọzọ ọnụ na-ekwuchitere APC n'Imo steeti bụ FCC Onwuasoanya Jones gbara arụkwaghị m n'ọrụ ya, wee gbaso Uche Nwosu site n'ibu onye isi nchịkọta achunta vootu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: ""O nweghi onye ọzọ ka Uche Nwosu mma"" - Okorocha" afirika-43912783,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43912783,Aha Lionel Messi ga-abụ aha ngwa ahịa,Otu ụlọikpe na mpaghara Europe ekpebiela na aha onye egwuregwu bọọlụ bụ Lionel Messi ga-abụ aha ngwa ahịa site ugbua.,"A etuola Lionel Messi ugo onye kachasị agba bọọlụ ugboro 10 Oruola afọ asaa ke mgbe Messi kpere ikpe a n'ụlọ ikpe ka aha mee ka aha ya bụ aha ngwa ahịa. Mana ụlọọrụ akporọ Massi sị mba, na aha Messi yiri aha nke ha. Ụlọikpe a kpebiri na Lionel Messi bụ onye ama ama, na aha ya anaghị eme mgbagwoju anya. Mkpebi a na-abịa ụbọchị ole na ole akwụkwọ ntaakụkọ egwuregwu bọọlụ ndị ala France dere na Messi agafeela Cristiano Ronaldo dịka onye kachasị anata ego. Ugbua, Messi na anata nde pounds 108 mana Ronaldo na-anata nde pounds 94. Messi dị afọ 30, enyeela ọkpụ ruru 600 n'ime ọnwa nke garaaga. Ọ bụ onye kachasị nye goolu n'otu Barcelona n'otu egwuregwu mba Argentina. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-53790129,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53790129,Ihe iri Afrịka rụpụtara n'ihi Covid-19,"Dịka mba Afrịka gafere ọnụọgụgụ otu nde na ndị butere ọrịa coronavirus, ndị na-arụpụta akụrụmgwa na-enye aka n'ịlụso ọrịa agha site n'ịrụpụta ihe ga-enyere ndụ aka n'oge a.","'Doctor robot' n'ụlọọgwụ Lee ihe iri n'ime ndị ahụ anyị họpụtara: 1. ""Doctor Car robot"" Ụmụakwụkwo na Polyteknik Dakar nke dị na Senegal arụọla otu ịgwe ga-enyeaka belata mfesa ọrịa ahụ site na dọkịta rue na onye ọ na-agwọ. Igwe ahụ nwere oseefoto nke ha tinyere ya n'ime a ga-esinwu n'ebe toro aka na-apị. Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na igwe a nwereike ịnye ndị mmadụ edopuru iche nri na ọgwụ. 2. Igwe nkwọmaka Stephen ritere ntụrụgọ n'aka onyeisiala mba Kenya maka ihe a ọ rụrụ Nwata akwụkwọ mba Kenya dị naanị afọ itoolu mepụtara ọsịsị igwe nkwọmaka iji belata mfesa covid-19. Igwe ahụ nyere ndị mmadụ aka ịkwọ aka n'emetụghị ihe ọbụla aka kama jiri ụkwụ ha emetụya. E nyere Stephen ntụrụgo n'ọnwa Juun maka nke a. 3. Igwe nkutume'RESPIRE-19' Usman Dalhatu sị na ọ na-eche ka nyocha igwe nkutume ya pụta Dịka ụkọ nkutume na-abawanye n'ụlọọgwu na Naịjịrịa, nwata akwụkwọ dị afọ 20 aha ya bụ Isman Dakhatu gbalịrị ịnye aka. Dalhatu na-agụ 'Engineering' rụpụtara igwe ahụ ga-enyere ndị mmadụ aka ịku ume. O kwuru na ọ na-achọ ịrụ ihe ruru iri abụọ. 4. Ịbipụta mkpuchimi nke 3D Mbipute si na 3D nyere ha aka ibiputa mkpuchimi otu narị kwa ụbọchị Natalie Raphil bụ onye chọpụtara ụlọọrụ ""Robots Can Think"" na mba Saụt Afrịka. O ji ihe mbipute nke 3D arụpụta akwa mkpuchi imi ruru otu narị kwa ụbọchị. Ọ na-ekesakwa nke a n'ụlọọgwụ ndị a ma ama n'obodo Johannesburg. Ọ kara ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na mba Afrịka nọ na mba Saụt Afrịka. 5. Ite ịkwọaka nke ji 'Solar' arụ ọrụ Ọrụakpụụkwụ bụ Richard Kwarteng na nwanne ya nwoke bụ Jude Osei chepụtara ma rụọ ite ikwọaka nke ji anwụ arụ ọrụ iji kwalite ndebe ebe ọbụla ọcha. Mgbe aka mmadụ bịara igwe ahụ nso, ọ wepụta mmiri ncha ma kpọọ oku mgbe ntabianya 25 gachara iji chetara onye ahụ ya kwodebe aka ya dịka iwu WHO si kwuo. 6. Nnyocha ngụ site n'ịntanetị Ndị ọrụ injinia na mba Tunishia arụpụtala peeji ịntaneetị na-elebanye anya na nnyocha ngụ mmadụ ịma ma onye ahụ enwereike ibu coronavirus. Ndị nnyocha na National Institute of Applied Science and Technology n'obodo Tunis sị na o ji pasentị iri itoolu achọpụta ma mmadụ ebu ọrịa a n'ezie. Aka na-ahazị ya bụ peeji ọfụma ka o nwee ike na-enweta nnyocha ahụ ọfụma nakwa ịghọta etu covid-19 si emebi ngụ mmadụ. 7. Ndịuweojii nke igwe kọmpụta Gọọmentị mba Tunishia wepụtara ndị uweojii igwe kọmputa n'okporoụzo isi obodo ha bụ Tunis n'ọnwa Eprelu iji kwụsị ndị mmadụ ịpụta n'ilo. Igwe ndị a akpọrọ 'PGuards' jụrụ onye ọbụla ha hụrụ n'ilo ihe ha na-eme ebe ahụ ma jụkwa ha maka akwụkwọ ikike ha nwere. O nwere ihe dị icheiche dị n'ime ya dịka oseefoto, ihe na-achọta ọkụ nakwa ihe na-egosi ya ụzọ. 8. Osịsị na-ehicha ego Otu onye na-arụ ọrụ ego bụ Danson Wanjohi rụrụ osisi a na-ehicha ego ma etinye ya n'ime ya bụ igwe. O ji injin, rọba nakwa 'gear' were rụọ ya bụ osisi nke na-ehicha akwụkwọ ego ọbụla etinyere n'ime ya site na mmiri 'sanitizer' dị ya n'ime. 9. Ngwa nyocha covid-19 nke nsonso Ndị ji ego achụ ego abụọ na mba Sawụt Afrịka bụ Daniel Ndima na Dineo Lioma arụpụtala ngwa nyocha covid-19 nke na-ewepụta mpụtara n'ime naanị nkeji 65. Ọ na-ewebu ihe ruru ụbọchị atọ tupu mpụtara ndị enyochara maka ọrịa a apụta. Akpọrọ ngwa nyocha a qPCR nke a na-elebanye anya tupu enya ya ikike ịrụpụta. 10. Ịnọte aka akpụ isi Na mba Itiopia, ndị na-akpụ isi achọtala ụzọ ọhụrụ ha ga-esi kpụ ndị mmadụ isi n'emetụghị ha aka. Ndị ahụ na-akpụ isi na anọ n'ime igwe arụpụtara na-ekewa ha na ndị ha na-akpụ isi nke nyere aka belata mfesa ọrịa coronavirus." egwuregwu-43031392,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43031392,Dani Carvajal: Onweghi ọgwụ ga egbochi Neymar,"Dịka a na-akwado igba asọmpi Eufa Champions nke agba iri na isii n'ime izuka a, ebe ndị Real Madrid ga-ezute ndị Paris Saint-Germain.","Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG Onye na-agbara Madrid bọọlụ bụ Dani Carvajal kwuru na onweghi ""ọgwụ"" nwereike igbochi Neymar, dịka ọ na-atụ anya ka Neymar laa ezụmike n'otu ụbọchị. Neymar dịka ihe iyi egwu nye ndị Madrid dịka ha na-aga izuta ndị PSG n'asọmpi ụkwụ nke mbụ. Carvajal, onye na-agaghị agba bọọlụ nke mbụ a si; ""Mgbe gị na Neymar na-amaka bọọlụ, o nweghi ụdị ọgwụ ọbụla pụrụ igbochi ya emela nke ọma."" Ọ sikwa ka ndị Madrid ""Nwe olileanya ka ọ [Neymar] ghara ị nọ n'ụbọchị ọma ya"" O kwuru na amabeghi onye ga-eme nke ọma n'asọmpi ahụ ga-adị n'etiti ndị otu abụọ ndị a." afirika-49073945,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49073945,Shiites protest in Abuja: Ndị Shia gburu otu onyeisi anyị n'Abuja - Ndị uweojii,"Ndị uweojii sị na onye uweojii bụ onyeisi ngalaba ""Operations"" n'Abuja bụ DCP Usman A.K Umar nara mmụọ n'ọgbaghara dara n'etiti ha na ndị otu ""Islamic Movement of Nigeria"" (IMN) e ji ""Shia"" maọbu ""Shiites"" mara.","Ọgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja Ndị Shia n'onwe ha gwara BBC na mmadụ 11 n'ime ha nwụrụ na ọgbaghara ahụ mere n'Abuja n'ụbọchị bụ nke iri abụọ na abụọ nke ọnwa Jụlaị. Ndị uweojii sị na ebugara DSP Umar ụlọ ọgwụ mana ọnyaghị. Ha asịkwa mmadụ abụọ nwere ọkwa ""Assistant Superintendents of Police"" nakwa onye ọrụ ụlọ ọrụ Channels Television merụrụ ezigbote ahụ. Ndị uweojii sị na ndị a gbakwara ụlọ ọrụ ndị gbata gbata ""National Emergency Management Agency"" (NEMA) na ụgbọala abụọ ọkụ. Nke a bidoro dịka ha na-eme ngagharị iwe ka gọomentị tọhapụ onyeisi ha bụ El-Zakzaky onye e ji na mkpọrọ kemgbe afọ 2015. Onye na-ekwuru ndị Shia bụ Ibrahim Musa gwara na ndị otu ha nwụrụ bu apa egbe n'ahụ. Ọ sị na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ nwereike rịa elu maka ndị uweojii Naịjirịa buru ụfọdụ ozu laa. Ndị Shia sị na mmadụ 11 nwụrụ n'ọgbaghara a. Ndi uweojii si na-egburu otu onyeisi ha Ndị uweojii sị na ha ji mmadụ 54 ha nwụchịrị n'ọgbaghara a. Ha dere akụkọ na soshal midia ha na-ebo ndị a na-eme ngagharị iwe ebubo na ọ bụ ha butere nsogbu a. Ndị uweojii kwukwara na ha na-agbalị ihu na udo chịrị. Ndị Shiites na-ekwu na ụmụnwanyi na ụmụaka ha so na ndị a gbara egbe. Ndị uweojii dere n'akara Twitter ha na nsogbu a kacha na mpaghara ""Central Business District"" na ""Three arms Zone"" nke Abuja. Ha kwukwara na ha na-agbalị ime ka ọgbaghara a belata. Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na Soshal Midịa ekwu ihe mere ma na ekwukwa uche obi ha. Lee ihe ụfọdụ ndị mmadu n'ekwu - Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Punch tinyere ihe onyonyo na egosi ụgbọala ndị gbatagbata a na akpọ NEMA ebe ọ na agba ọkụ. Otu onye bụ Fidah Nurudeen zaghachiri ndị uweojii na twitter tinye ihe onyoonyoo kwuo na ha na-agba ụmụnwanyị na ụmụaka egbe. Ụfọdu dịka Tesleem Lawal na-ajụ sị ""Gịnị ka ụmụaka n'eme ebe a na-eme ngagharị iwe?"" Onye ọzọkwa jụrụ ma gọọmentị achorọ ka otu iyi egwu ọzọ dị ka Boko Haram billie? N'otu olu a ka Gimba Kakanda dọọrọ ndị gọomentị aka na nti na 'ọ bụ udịrị obị a ka ndị dịka Boko Haram siri bido'. N'afọ gara aga, ndị Shiittes na ndị uweojii chịpụkwara ya n'Abuja. Ndị Shiite na-eme ngagharị iwe n'Abuja" media-54716668,https://www.bbc.com/igbo/media-54716668,Lee ebe niile ndị Arochukwu gbara mgbọrọgwụ n'ụwa,Ndị obodo Arochukwu a na-akpọ Aro na mkpọbiri bụ otu n'ime ndị kachasị eme njem n'ala Igbo.,"Ebe ọbụla ha gara ha na-agba ezigbo mgbọrọgwụ ebe ahụ. Ndị Arochukwu bụ ndị mgbọrọgwụ ha malitere n'Abia Steeti ma nwee ogbe karịrị otu narị na iri na atọ (113) bụ ebe ndị obodo ha bigasị. Gịnị mere ndị Aro ji gbasaa etu a? Maazị Chima Dike bụ onye omenala ndị n'Arochukwu doro anya Maazị Chima Dike kọwaara BBC Igbo ka ndị Arọ siri gbasaa ebe niile. N'olu ya, ""Ọ bụ ịzụahịa bugara ndị Aro ebe niile ha nọ n'ala Igbo nakwa mbaụwa gbaa gburugburu"". Ọ sị na ọ bụ ịgba ohu bụ ahịa ndị Aro jiri malite ịzụ ahịa n'agbata afọ 1500 ha na ndị Pọtugal, tupu ndị Briten abatazịa ebe 1901 na 1902. O kwuru na ịgba ohu guzowere na nkwenye chi Ibini Ụkpabi bụ oke Arụsị Igbo niile tụkwasara obi maka nchekwa. Lee emume iri ji ndị Arochukwu Nke a mere e ji akwaneyere ndị Aro ugwu ebe ọbụla ha nọ. Ụfọdọ na-akpọbata ndị Aro n'obodo ka ha nyeaka ichekwa obodo n'aka ndị na-agba ohu nakwa ndị na-ebuso ha agha. Ebe ọbụla ndị Aro nọ ndị obodo ahụ na-akwanyere ha ugwu dịka ndị bụ ọnụ na-ekwuru Ibiniụkpabị, mere e ji enye ha ọnọdụ ka diala n'ebe ndị ahụ. A na-atụkwasị ndị Aro obi dịka ndị eziokwu na ndị na-ekpe ikpe kwụ ọtọ, nke mere ha jiri bụrụ ndị ọkaikpe n'obodo ndị a. Ha na-eburu ndị meruru ala nye Ibiniụkpabi dịka ohu ha na-ere n'ofesi ebe ndị nwe ha agaghịzi ahụ ha anya. Nke a mere ndị Igbo jiri were gbasaa na mba niile n'ụwa. Ọ bụ ya mekwara Igbo niile ji akwanyere ndị Arọ ugwu pụrụiche nke turu ndị ọcha n'anya mgbe ha batara n'ala Igbo. Nke a mere ndị ọcha ji na-ebuso ndị Aro agha, iji kwatuo ọchịchị ha ma napụkwa ha ụfọdụ ike ha nwere. Ụbọchị ọzọ ka a chụọ ntaakụkọ agha a n'owere nchi. Mana mgbe nwabekee meriri ya bụ agha, ịgba ohu kwụsịrị, ndị Aro malitezie ire mkpụrụ nkwụ na mmanụ nri sitekwa n'otu ụzọ ahụ ha si zụọ ahịa ohu. Lee ebe ndị Arọ nwechara obi Biko buru n'obi na a ka na-ebepụtakwa ebe ndị ọzọ na-adịghị ebe a. Aro nwekwere ọtụtụ ogbe n'ala Bekee. Anyị ga-edepụtakwa ha ebe a mgbe anyị ga-enwete ha. Ọtụtụ ndị a na-ahụtazị onwe ha dịka ndị obodo ahụ n'agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ha ka na agakwa Arochukwu. Kedụ ihe jikọtara ndị Aro niile ugbua? Ugbua ọtụtụ n'ime ndị Aro niile a ka na aga Ikeji n'Arochukwu kwa afọ. N'ọnwa Septemba afọ dum, ọtụtụ n'ime ha na-aga Arochukwu ịwere nzu na-enye ha ikike ịme Ikeji nke ha n'ụlọubi ha. Nke a bụ ụzọ ndị Aro niile a si emekọrịta ruo echi. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-47392134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47392134,Nigerian Senate: Ụlọomeiwu abụzị ebe 'ezumiike nka' ndị gọvanọ?,"Na ntuliaka e mere ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị 2019 a, gọvanọ ise chịburu steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu.","Ihe ọzọ jịkọrọ mmadụ ise a bụ na ha chịchara steeti ha afọ asatọ (ugboro abụọ) tupu ha azọta oche a. Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ na-ajụ ma ụlọomeiwu Naịjirịa abụzị ebe 'ezumiike nka' ndị Gọvanọ? BBC Igbo chọrọ ịkọwara gị etu ndị gọvanọ a na ije butere ha n'ụlọomeiwu si gaa. Ndị nke ka ""na-abịa abịa"" 1) Rochas Okorocha Okorocha dị ọnọdụ ka ""JJC' n'ụlọomeiwu, makana ebe ụfọdụ ndị otu ya garala ugboro ugboro, nke a ga-abụ mbụ ọ ga-anọ n'oche ahụ dịka onye omeiwu Naịjirịa. Na ọ ga-abụ ""JJC"" n'ụlọomeiwu dịka ọ zọtara oche ndị ""Orlu zone"" na ntuliaka 2019 a, apụtaghị na Okorocha bụ anụ taa n'ihe gbasara ọchịchị. O bu ụzọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003, n'okpuru ""All Nigeria Peoples Party (ANPP)"", o mechara hibe pati Action Alliance (AA) n'afọ 2005. Okorocha anọkwaala na pati PDP, mana n'APGA ka ọ nọ oge ọ zọtara oche aka na-achị Imo steeti n'afọ 2011; Ọ banyere APC ebe ọ nọ chịa Imo nke ugboro abụọ. Okorocha kwuburu n'afọ 2018 na ọ gaara azọ ọkwa onyeisiala, mana ọ gbajọrọ ime ya makana Onyeisiala Muhammadu Buhari bịara kwuputa uche ya na ọ chọrọ ịzọgharị. Orji Uzor Kalu Kalụ bụkwa ""JJC' bụ onye ọzọ anaghị ata ntị ya ata na-aga Ụlọomeiwu Ukwu n'afọ 2019 a. Ọ zọtara oche Abịa Nọt n'okpuru pati APC, mere na ọ ga-abụ mbụ ọ na-aga n'ụlọomeiwu ukwu. Kalu chịrị Abịa steeti site n'afọ 1999 ruo 2007 n'okpuru pati PDP, ọ zọkwara ọkwa onyeisiala n'afọ 2007, n'okpuru ""Progressive Peoples Alliance (PPA)"" bụ pati o hibere. Ndị nke na-alọghachị Sam Egwu Egwu chịrị dịka gọvanọ Ebọnyị steeti n'okpuru PDP site n'afọ 1999 ruo 2007, ma zọte oche n'ụlọomeiwu ukwu dịka onye na-anọchi anya ndị Ebọnyị Nọt n'afọ 2015. Ọ zọtakwara oche ya ọzọ na ntuliaka nke afọ a, nke bụ na ọ ga-anọkwa ebe ahụ afọ anọ ọzọ. Egwu rụrụ dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ site n'afọ 2008 ruo 2010. Theodore Orji Orji a ma dịka T.A Orji, na-alọghachị n'ụlọomeiwu ukwu ebe ọ na-anọchite anya ndị Abịa Sentralụ kemgbe afọ 2015. Ọ chịrị Abịa steeti site n'afọ 2007 ruo 2015. Orji bụ gọvanọ mbụ si ụlọmkpọrọ banye ọkwa ọchịchị na Naịjirịa. Ọ nọ n'okpuru pati PDP. Chimaroke Nnamani Nnamani akatala ahụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị. Oche ọ zọtara na ntuliaka 2019 a emeela ya ugboro abụọ ọ na-aga Ụlọomeiwu Ukwu. O bu ụzọ zọta oche ndị Enugu-East n'Ụlọomeiwu n'afọ 2007 ruo 2011, ka ọ chịchara Enugu steeti dịka gọvanọ site n'afọ 1999 ruo 2007. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46015369,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46015369,Tony Anenih: Ị ma ihe jịkọrọ ya na Nnamdi Azikiwe?,A mụrụ Anthony Akhakon 'Tony' Anenih na Uzenema-Arue dị n'Uromi nke Edo steeti n'afọ 1933.,Ọkwa ikpeazụ o nwere bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ n'ụlọ obibi n'afọ 1999 mgbe Olusegun Obasanjo rịrị ọkwa onyeisiala. Amalitere itu ya aha 'Mr Fix It' n'ihi mbọ ọ na-agba n'ihe gbasara ntuliaka ọ kachasị etu o si nye aka chiburu Edo steeti bụ Samuel Ogbemudia aka n'imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ n'afọ 1983. Ụfọdụ ụlọntaakụkọ dị na Naịjirịa na-ekwu n'ọnwụrụ ụnya ahụ n'ụlọọgwụ dịka ọrịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka. Lee ihe ise ị na-amaghị maka ya ebe a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị afirika-50198703,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50198703,Fulani herdsmen crisis: Allen Onyema emekwaala ihe nyịrị mmụọ na mmadụ,Akụkọ ndị dị mkpa Air Peace ekpeziela udo n'etiti Miyetti Allah na Benue steeti,"Gọọmenti Benue steeti ekwuola na ndị otu Miyetti Allah arịọla ndị steeti ahụ mgbaghara maka oke ogbugbu nsogbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọru ụgbo butere na steeti ahụ. Ode akwụkwọ Miyetti Allah n'ogo federalụ bụ Saleh Alhassan gosiri oke nwute maka oke ogbugbu nsogbu a dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo na-ebute ma kwe nkwa ime ka mkpezi udo a tọ atọ. Ọ bụ onyeisi ụlọrụ njem ụgbọelu Airpeace aha ya bụ Allen Onyema kpeziri udo a n'etiti Miyetti Allah na Gọvanọ Samuel Ortom na Makurdi n'ụbọchị Oktoba iri abụọ na isii. Ndị fada a ga-amalite ịlụ nwanyị? Ndị ụkọchukwu ụka Katọlik Ndị Bishop ụka Katọlik na mpaghara a kpọrọ Amazon ekwekọrịtala ka a na-echi ụfọdụ ụmụnwoke lugoro nwaanyị ụkọchukwu. Ha nwere nkwekọrịta a oge ha nwechara ọgba na Vatican. Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu agaghị alụ nwaanyị. Mana oteela ndị mmadụ na-ekwu ka e lebaa iwu ahụ anya. Tụmadị n'ebe ụfọdụ ndị ụkọchukwu kọrọ ụkọ. Pope Francis Mpaghara Amazon gụnyere akụkụ ụfọdụ na mba Brazil, Peru, Chile, Bolivia Ecuador Venezuela na ndị ọzọ. Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ebinyebeghị aka na nkwekọrịta a. Akwụkwọ visa ọhụrụ Onyeisi ndị 'Immigration' Mohammed Babandede na-egbuchapụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mbata na ọpụpụ ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Immigration service na-atule iwepụta ụdị akwụkwọ visa atọ ọzọ. Onyeisi ngalaba a bụ Mohammed Babandede kwuru na visa atọ ọhụrụ a ga-eme ka ọdịwanye mfe ndị mmadụ ịbata Naịjirịa. Babandede kọwara na vịsa ndị a gụnyere nke ndị na-abịa njem nlere anya (tourist), nke ndị na-abịa ịchụ nta ego (investors), na nke ndị na-abịa ezumike nka. Nnwereonwe Catalonia Ndị ntọrọbịa na-eme ngaghariwe n'ihu ụlọọrụ ndi uweojii dị na Barcelona ụbọchị satọde Ihe ruru mmadu puku narị atọ n'ụma emeela ngaghariwe na Barcelona maka mkpọchị n'ụlọ mkpọrọ onye ndu ndị Catalonia dị na Spain na-achọ nwereonwe ruo ugbua. A haziri ya bụ ngaghariwe iji wee kwado ọchịchọ nwereonwe obodo ahụ na-arịọ kamgbe afọ 2008 mba Spain nwechara nsogbu akụ na ụba. Cheta na ụlọikpe dị na Spain nyere iwu ka akpọchie ndị isi Catalonia na-achọ nwereonwe ruru itoolu n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Oktoba rue afọ itoolu maọbụ iri na atọ n'ụlọ mkpọrọ. Ndị ọreụ gbata gbata na-ekwu na ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ kamgbe ngagharịwe a malitere nso nso a. Ebe, Ebe onyeisiala mba Chile bụ Sebastian Pinera achụọla ndị imeụlọ ụlọrụ ya niile ka o wee ghọpụta ndị ọhụrụ ga-enyere aka gboo mkpa kpatara ngaghariwe ndị mba ahụ mere nso nso a. Mgbapụta ụmụakwụkwụọ atọrọ na Kaduna Ndị uweojii nọ na steeti ahụ na-ekwu na ọ bụ kepu kepu amamihe ha nwetere mere ka ha gbapụta ụmụaka ahụ Ka abali atọ gafechara, ndị ntọ ahapụla ụmụakwụkwọ nwaanyị isi nakwa ndị ọrụ abụọ nke ụlọakwụkwọ Engravers dị na Kakau Daji, n'okpuru ọchịchị Chikun dị na Kaduna. Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Yakubu Sabo kwuru na ha gbaputara ụmụ akwụkwọ ahụ n'ezie n'abali satọde. Mana ụfọdụ ndị ntaakụkọ depụtara na, nne na nna ụmụaka ahụ kwụrụ ihe karịrị nde naira iri na atọ maka mgbaputa ha. Onyeisiala etoola ụmụ Naịja Otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa ndị erubeghị afọ iri na asaa pịawara ndi otu Hungary azụ n'abalị Satọdee. Ha ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ wee merie ha na asọmpi nke mmepe iko mba ụwa afọ 2019. N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, ike ụmụaka ahụ kpara tụrụ onyeisiala n'anya. Buhari bunyere ha ụkpa ekele ma gbaa ha ume ka ha jide ka ha ji. Naịjirịa ga-ezute Ecuador n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Oktoba. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'" afirika-48026249,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48026249,PMBInLagos: Ndị mmadụ na-aba mba na a rụchabeghi ihe ndị Onyeisiala Buhari na-abịa ịgbape,Buhari alaghachịla n'Abuja ka ọ bịara Legọs mana ụfọdụ ndị bi na Legọs na-eti mkpu na soshal midia ka Onyeisiala Muhammadu Buhari na-abịa steeti ahụ ịgbape ọrụ ụfọdụ n'ụbọchị Wednesde.,"Foto ọdọụgbọala ọhụrụ n'Oshodi onye ntaakụkọ BBC sere ụbọchị Tusde Ọrụ ndị a gụnyere ụlọọgwụ ""Institute of maternal and child health"" dị n'Ikeja; ụlọ ifo akpọrọ ""Lagos Theatre Oregun""; okporoụzọ akpọrọ ""Oshodi Transport Interchange""; ụgbọala ọhụrụ a ga-eji na-ebu mmadụ nakwa ụzọ ọhụru nke e si aga n'ọdọụgbọelu. Ụfọdụ ndị bi Legọs sị na ọrụ ka na-aga n'ihu n'ọdọụgbọala njem ahụ dị n'Ikeja Onyeisiala bịara gbapee n'afọ gara aga. Nke pụtara na ọ bụ sọsọ ihe a ka na-arụ arụ juru na Legọs ka Onyeisiala na-abịa ịgbape. Mgbe onye ntaakụkọ BBC Pidgin gara ebe ihe ndị a dị, ọ chọpụtara na ọ bụ eziokwu na ọrụ ka na-aga n'ihu. Onye ntaakụko BBC Pidgin kwuru na ọrụ ka na-aga n'ihu na mgbede Tusde Ọrụ ka na-aga n'ihu n'ọdọụgbọala Oshodi Ọdọụgbọala ahu akpọrọ ""Oshodi Transport Interchange"" N'ọdọụgbọala ahụ akpọrọ ""Oshodi Interchange Terminal"" ọrụ ka na-aga n'ihu mgbe onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ na mgbede Tusde.Ọzọ bụ ụzọ ọhụrụ na-aga Ọdọụgbọelu Murtala Muhammed bụ ebe ọtụtụ ndị ọrụ nọ na-arụ ọrụ. Ọrụ ka bụ aja n'aka dị n'ụzọ ahụ. Ọrụ na-aga n'ihu na ụzọ Ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Agbanyeghi nke a, otu onye na-aru ọrụ na gọọmentị Legọs achọghị ikwu aha ya sị na ọrụ ebiela. Ọ sị; ""Na a ka na-arụ ọrụ a abụghị na arụchabeghị, ọkachasị ebe ọ bụ ụzọ ka a na-ekwu okwu ya. Ụzọ agbapeela kemgbe izuụka abụọ. Onyeisiala agaghi abịa ịgbape ụzọ arụchagbeghị"" Foto ụzọ ọhụrụ onye enyemaka aka na-achị Legos zitere BBC Pidgin Foto ""Oshodi Terminal"" gọọmentị Legọs zitere Foto ụgbọala ọhụrụ legọs steeti gotere Foto ""Ayinke house"" dị na LASUTH BBC enwetaghi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi mana ekwentị ya akụghị. Kọmịshọna nke ọrụ asabeghi ""email"" e zigaara ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45088455,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45088455,BBC Pidgin ahaziela ịmaaka n'edemede asụsụ Pidgin,Ogbo anyi n'ụlọọru ntaakụkọ BBC bụ BBC Pidgin ewepụtala atụmatụ ụmụakwụkwọ nọ mahadụm dị ichieichie na Naịjirịa ga-eji maaka n'ide akụkọ n'asụsụ Pidgin.,"Ndị ga-eso n'ịma aka ahụ ga-edere ndị haziri ịmaaka a akụkọ mkpụrụokwu ya si narị asatọ (800) ruo otu puku (1000) nke metụtara isiokwu ""Ndi ntoroọbịa Afrịka ha dịla njikere ịchị ọchịchị."" nke a ga-eziga n'akara email a bbcpidgin.essay@bbc.co.uk . Ndị ga-etinye anya n'asọmpị a iji họpụta ndị akụkọ ha nwere ume si Naịjirịa, Gana na Kameron. Ndị a nwere ndị ọkamụta, ndị ode akwụkwọ Pidgin na ndị ntaakụkọ n'ime ha. A ga-akwụrụ nye meriri asọmpị ụgwọ akwụkwọ oji agụ na mahadụm Ha ga-ahọpụta onye mmeri na ngwụcha. Iwu ji edemede Pidgin ga-echekwa atumatụ a. Ya bụ, onye ọbụla chọrọ ị ga n'ihu n'asọmpị a ga-ahụ na edemede ya kwụ ọto. A ga-akpọpụta onye meriri n'asọmpị a n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2018. Onye meriri ga-enwete uru, nke ị kwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ oji aga mahadụm n'otu afọ. Ịmaaka a malitere taa, ọ ga-emechi n'abalị abụọ nke ọnwa Seputemba. Zigara bbcpidgin.essay@bbc.co.uk akụkọ gị ugbua. Onye ndụ BBC Pidgin bụ Adejuwon Soyinka sị: ""Atụmatụ edemede na Pidgin a bụ mbụ ụlọ ntaakụkọ dịka BBC na-eme n'ụwa. E mere ihe a iji kwado edemede na Pidgin na Mpaghara Afrịka nke ọwụwa anyanwụ."" Onyeisi BBC nke asụsụ dị icheiche n'ọwụwa ọdịda anyanwụ nke Afrịka bụ Oluwatoyosi Ogunseye si: ""Kemgbe otu afọ gara aga BBC Pidgin bidoro bụ oge ezigbote ọṅụ. Nke mere ịmaaka a ga-akwado iji asụsụ Pidgin na-akparịta ụka n'etiti ndị ntoroọbịa."" Ga na BBC Pidgin ka-inwete ihe gbasara akụkọ a n'uju." afirika-47109329,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47109329,2019 Elections: Atiku abụghị onye Naijiria - Nnamdi Kanu,Ụfọdụ mmadụ akatọọla ebubo onye ndu otu IPOB bụ mazị Nnamdị Kanụ boro megide Atiku Abubakar ji aha otu pati PDP azọ ọkwa onyeisiala na Naijiria.,"Kanu nọọrọ ụbọchị Satọde, na mgbasa ozi omere site na mba Briten kwuo na Atiku bụ onye obodo dibu na mba Cameroon. O bukwara ebubo na Atiku wetara ọdịda na ntụliaka onye bubuuru osote onyeisiala Naijiria bụ Alex Ekwueme nwụrụla anwụ n'obodo Jọs n'afọ 1999. Ọ gwaziri ndị otu ya ka ha hapụ ịtụ vootu na ntụliaka na-abịa, rue mgbe ndị nọ n'ọchịchị bịanyere aka na-akwụkwọ nkwenkọrịta e nyere ha. N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya site n'ekwe ntị, onye ọnụna-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị bụ Ifeanyị Ọlụmba, kọwara ebubo a dịka okpotokpo asị, ma kwuo na nke a bụ iji kpasuo ndị mmadụ iwe. O kwuru, ''ndị mmadụ kwesiri ị jụ okwu a n'ihi na nke a ga-ebutara ha mkpasu iwe''. Na nke ya, mazị Paddy Anyatọnwụ, kọwara nke a dịka okwu e jirila mara Nnamdị Kanụ. O mekwara ka a mata na mgbe mbụ, Kanụ bokwara ụdị ebubo a megide onyeisiala Buharị mgbe o kwuru na onyeisiala Naijiria si mba Sudan. Ọ rụtụrụ aka, ''Nnamdị amaghị ihe ọ na-ekwu n'hi na o kwukwaala ụdị okwu a gbasara Buhari''. Ha dụziri ndigbo ọdụ ka ha sonye na ntụliaka n'abịa i ji hazie ọnọdụ ha na Naijiria. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55582006,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55582006,"Zebrudaya, Okonkwo, Jagua na ejije TV ise nyere ndị mmadụ ọṅụ n'afọ olemole gara aga",Igwe onyonyo 'television' so n'otu ihe Teknụzụ rụpụtara nke bụ ọgbaraigbo gharịị.,"Ejije 'New Masqurade', 'Things fall apart', na Jagua Jagua so n'ejije nyere ndị mmadụ ọṅụ n'afọ ndị gara aga Mana e wepụ ejije, egwu na akụkọ ụwa, igwe TV ga-abụ akpati nkịtị. Ọtụtụ ejije jupụtara na TV taa, nke e ji akụzi ihe, enwerị obi aṅụrị nakwa agbasa ozi dị mkpa dị icheiche. Ị jụọ ndị ntorobịa ugbua aha ejije TV ha ma, ị ga-anụ ihe dịka 'The Johnsons', 'My flatmates', dịrị gawazie. Mana ejije ndị a nwere ndị tọrọ ha, ndị a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa malite n'afọ iri abụọ ruo afọ iri isii gara aga. Akụkọ a bụ iji kọọrọ ndị ntorobịa ihe ejije TV dịka ya n'afọ ndị gara aga, ma chetakwara ndị okenye ụfọdụ ejije ndị kpara ha obi ọma. 1. Zebrudaya (New Masqurade) Ndị so mee ejije 'New Masqurade N'afọ 1974 ruo n'etiti afọ 1990 ga, ka ejije a bụ 'New Masqurade wuru ewu. Ihe ọtụtụ ji mara ejije a n'oge ahụ bụ 'Zebrudaya', nke bụ aha onye a kacha mara na ya bụ ejije. Otu egwu e ji mara ya bụ 'Eddie Kwansa bio bio, izu ka mma na nne ji o, bịa o bịa'. Ọ bụ ụlọọrụ ntaakụkọ 'East Central State Broadcasting Corporation', nke mechara bụrụ 'Nigeria Television Authority' (NTA) Enugu, chịkọbara ejije a. Ndị so n'ejije a gụnyere: N'ime ndị niile so n'ejije New Masqurade, naanị Chika Okpala (Zebrudaya) bụ onye ka na-apụta n'onyonyo N'ime ndị a niile, naanị Chika Okpala bụ onye ka na-apụta n'onyonyo n'ejije ndị e ji ere ahịa (adverts) ugbua. 2. Okonkwo (Things Fall Apart) Ọ bụ odogwu Igbo bụ Chinua Achebe dere akwụkwọ ọ kpọrọ 'Things fall apart' n'afọ 1958. Mana n'afọ 1987 ka ụlọọrụ NTA tinyere ya n'ejije nke na-egosi na TV kwa izuụka nke wuru ewu ma kpọtụọ akpọtụ n'oge ahụ. Ejije a kọrọ akụkọ maka otu nwoke aha ya bụ Okonkwo nakwa etu o si gbaa mbọ ichekwa omenala obodo ya bụ Umuofia oge ndị ọcha batara. Ndị so n'ejije a gụnyere: Pete Edochie kpara agwa dịka Okonkwo n'ejije 'Things Fall Apart' 3. Village Headmaster Ejije a so n'ejije nke mbụ nke ụlọọrụ NTA mepụtara, ma bụrụkwa nke kacha mee ogologo oge na TV. Ya bụ ejije nke malitere n'afọ 1968 ruo afọ 1988, kọrọ akụkọ maka obodo a kpọrọ Oja, nke eze na-achị ya na-adabere na ndụmọdụ onyeisi ụlọakwụkwọ dị n'obodo ahụ. Ndị so n'ejije a bụ: 4. Cockcrow at Dawn Ejije a malitere n'ọnwa Eprel afọ 1980 iji mee ka ndị mmadụ mata maka atụmatụ a kpọrọ 'Green Revolution' nke onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Shehu Shagari wepụtara. Ọ bụkwa ụlọọrụ NTA tipụtara ya, nke onye dere ya bụ Peter Igho Ndị so n'ejije a gụnyere: 5. Jagua Nke a bụkwa ejije ọzọ nyere ndị mmadụ ọṅụ n'oge gboo. Akụkọ kwuru na ejije a malitere n'afọ 1968, mana ruo na ngwụcha afọ 1990 ga, ya bụ ejije ka bụkwa egwu eji. Ọ bụ Afolabi Afolayan, onyeọrụ ntaakụkọ NTA n'oge ahụ, dere ejije a ma kpakwaa agwa dịka 'Jagua'. Ejije ndị ọzọ Ụfọdụ ejije ndị ọzọ wuru ewu n'oge mbụ gụnyere:" afirika-45316134,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45316134,Kolo ego: Ọ bụ ndị mmụọ ka ọ bụ oke yi akwa na-ezu ego ndị mmadụ?,"Ụfọdụ ndị ekwenyela na ọ bụghị 'juju' na-akpị ego ndị mmadụ na-atụkọta na 'kolo' ha, na ọ bụ ha na-ezu ụmụnne ha ohi.","N'ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị bidoro ikwu n'elu soshal midia etu ego ha na-atụkọ n'ime kom kom a na-akpọ 'kolo' si na-efu na-emetụghị ya aka. Ụfọdụ ndị sị na ọ bụ ndị kapịnta rụrụ ya bụ kolo na-eji ọgwụ ewere ego ọbụla na-abanye n'ime ya. Ụfọdụ kwuru na ha atụkọọla ego ahụ ebe ọ ga-amụtara ha ọkpụrụkpụ ego, mana ihe anya ha hụrụ ka ha meghere ebe ego ahụ dị gbara ha anyammiri. Otu nwaanyị aha ya bụ Laila Ijeoma jụrụ na Twitter sị na ọ bụ 'ọgwụ ka ọ bụ nsị'? Nke a malitere okwu ebe ụfọdụ kwenyere na ha na-ezu ego ndị na-atụkọ ego na kolo ha, ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ 'ọgwụ' n'ezie, maka na ha agaghị akọnwanwu etu ego ahụ si efu. 'Ọ bụ 'ọgwụ' @nkechiaj kwuru na o mere nne ya (ebe o tụkọchara ego o fuo). @Ekiyokeyerin kwuru na ọ bụ ọgwụ, makana o mere nwanne ya nwoke. O kwukwara na ndị na-ere ya na-eji ọgwụ amịpụ ego n'ime ya. 'Ọ bụ ohi' @iamfia_A_Chris kwuru na o zuru nne ya ohi were zụọ 'Ps2'. @MileyBrian2 kwuru na oge nke ya mere, na ọ bụ ụmụ nwanne ya zuru ya ohi. @Adegboy23826114 kwuru na nwanne ya nwoke nọ na-ezuru nke ya. A ga-eji ịga gbachị ya bụ ụlọakụ? @nkechiaj kwuru sị na ọ ga-aga nwụchie kapịnta rụrụ nke ya ma ọ bụrụ na ọ hụghị ego nke ya ma o meghee ya, makana ọ bụ naanị ya bi n'ụlọ." 48884308,https://www.bbc.com/igbo/48884308,Ruga: Nwuchienụ ndị 'Northern Coalition' maka okwu asị - Ndị ọkaiwu,"Ndi ọkammụta n'ihe gbasara iwu Naijiria ekwuola na okwu ndị otu ndị Ugwu a kpọrọ 'Northern Coalition' kwuru bụ ""okwu asị"" nke nwere ike ibute ""ọgbaghara"" maọbụ ""agha"" n'ala Naijiria.","Ha gara n'ihu kpọọ oku ka ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ nwuchie ha. Otu ndị Ugwu dị icheiche gbakọtara ọnụ nye ndị gọvanọ ekweghị na'atụmatụ RUGA abali 30 iji gbanwe echiche ha, ọ bụghị otu ahụ, ha enye ndị abụghị ndị Ugwu bi n'Ugwu Naijiria ọsọ. Content is not available End of YouTube post, 1 Ha nyere iwu ahụ dịka gọọmenti etiti kwupụtachara na ha agbaala jim n'atụmatụ inye ndị ọchiehi ala na steeti dị iche iche na Naijiria. Mana Ọkaiwu Ifeanyị Olumba kwuru na okwu ahụ bụ 'Okwu nwere ike ibute agha."" ""Ụdị okwu ahụ na-amụnye obodo ọkụ. Ha na-eme ka ebe gọọmenti adịghị. ""Ndị uweojii na ndị DSS ga-aga lebanye anya, kpọrọ ndị ahụ gaa ụlọikpe."" Ọ gara n'ihu kwuo, ""Ọ bụrụ n'ọ bụ ndị Ipob kwuru ụdị ihe, e buru ụgbọ aha ga-izute ha."" N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Chima Nnaji kwuru na ""ihe ha kwuru bụ ihe megidere iwu. Ọ bụ okwu asị."" ""Ọ karịrị okwu asị n'ihi na ọ bụ ihe iwu kpọrọ 'treason.' na Bekee. O kwesịrị ka ndị uweojii na ndị DSS wakpo ha ebe ha gbakọrọ na-ekwu ihe ahụ."" Nnaji boro gọọmenti etiti ebubo anaghị eme onye ka e mere ibe ya na-etu ha si agbaso okwu asị. ""Ọ bụrụ Nnamdi Kanu, ọ bụghị na m na akwado ya, ha chọwa ya ka ha tụkpuo ya na nga. Mana anyị ma na o nweghị ihe a ga-eme."" O kwukwara na ihe ha mere gosiri na Naijiria akpụọla afọ n'ala. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48041865,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48041865,Ọgụ 'ndị otu nzuzo' ataala isi mmadụ atọ n'Umudioka n'ime ọnwa ole ma ole,Ndị obodo Akpom dị n'ukpuru ọchịchị Dunukofia dị n'Anambra Steeti ekwuola na ogbugbu egburu otu nwata nwoke n'oge olili di na nwunye agbara ọkụ bụ ikpe dị n'aka ndị uweojii.,"Ifeanyi Ikechukwu na Mmesoma nwunye ya ka ndị echere na ha bụ ndị otu nzuzo gbara ọkụ n'afọ gara aga. Mana Mgbe a na-eli di na nwunye ahụ n'ubọ Fraịde nke bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelu, ọgbaghara dapụtara bụ nke tara isi otu nwaokoroọbia onye Umudioka. Otu onye ọkanmụta bụ Harry Obi Nwosu, bụ onye Umudioka, gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na-egburu otu nwaokoroọbịa Umudioka n'oge olil Ifeanyichukwu Ikechukwu na nwunye ya. Maazi Nwosu kwuru na ha adọọla ụmụokoroọbịa obodo ha aka na ntị ka ha ghara ịkpa ọgbaghara ga-ebute ọnwụ mmadụ ọzọ. Otu nwoke na-ere ihe n'Akpom Umudioka kwuru na ọ bụ ihe nwute etu ụmụokorọbịa na-ala ndụ ha n'ịyị. Mgbe BBC Igbo gara n'ụlọ onyeisi obodo ahụ bụ Ọkaiwu Ikebudu, enweteghị ya, ebe ndị nọ n'ụlọ ya ekweghi enye akara ekwe ntị ya. Ọtụtụ ụmụokoroọbịa Umudioka a gbara ajụjụ ọnụ n'ahịa Afor Igwe Umudioka kwuru na ọ bụ ọgụ ndị otu nzuzo bidoro ịkwafu ọbara ahụ. Emeka onye achọghị ịpụta n'onoyonyo boro ebubo na Emmanuel bụ onye akpọrọ ya na nwunye ya ọkụ nọ n'otu nzuzo ""Senior Vikings"". O kwuru na ""ọ bụ n'ihi esemokwu dị n'etiti ha na ndị otu ""Ayes"" mere eji gbaa ya na nwunye ya ọkụ n'ụlọ ha n'afọ gara aga"". Ọ bụ izuụka gara aga dịka a na-eme olili ya na nwunye ka agbagburu onye ọzọ"". Nwa okoroọbịa ọzọ bụkwa onye Umudioka akpọrọ Ugochukwu kwuru na egwu jizi onye ọbụla n'ihi na onweghi onye ma onye ọzọ ha ga-egbu. Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na ndị uweojii enweteghi akụkọ na-agbara Ifeanyi na nwunye ya ọkụ mgbe ihe a mere n'afọ gara aga. Ọ si Kama na ọ bụ mgbe egbuchara nwokoroọbịa n'olili ka nyocha ha chọpụtara na ọ bụ ndị mmadụ gbara Ifeanyi na nwunye ya ọkụ. O kwuru na ọ bụ otu n'ime ndị a na-eche na ha bụ ndi otu nzuzo bịara ibute ọgbaghara n'olili Ifeanyi na nwunye ji egbe gbagbuo onye otu ha na-amaghi ama. Haruna kwuru na ndị uweojii anwụchiela onye ahụ gburu mmadụ dịka nyocha ka na-aga n'ihu ugbua. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43100222,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43100222,"Na Kano, ụmụaka atọ ekubiela n'ime ụgbọala",Nke a mere na ụzọ Warri/Ibo Road dị na Sabon Gari dị na okpuru ọchịchị Fagge.,"Ụgbọala a na-agbaghapụ n'ụzọ n'ala Naijiria karịrị akarị Akụkọ kwuru na ụmụ akọ anọ nke abụọ n' ime ha bụ ndị otu nne mụrụ na-egwu egwu n'akụkụ ụgbọala apasara kemgbe na otu ebe, ndị nọ ebe ahụ amaghị mgbe ụmụaka ahụ ndị dị ihe dị afọ abụọ rue afọ anọ jiri banye ma tọ n'ime ụgbọala ahụ. Atọ n'ime ha nwụrụ mana otu n'ime ha ghọgburu ọnwụ ma na-anara nleta n'ụlọọgwụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ DSP Magaji Musa Majia kwetara na ihe nke a mere. Ọ gara n'ihu kwuo na,""A kpọọla onye nwe ụgbọala ahụ maka ịgba ya ajụjụ. Nyocha na-aga n'ihu. Ihe achọpụtara a ga-eme ka ọha mara""." afirika-49956832,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956832,Dave Umahi: 'Onye nọchiri ụgbọala m ụzọ ga-anata ntaramahụhụ',Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola na ndị nchekwa ya nwere ikike igba onye ọbụla nọchiri ụgbọ ala ya n'okporo ụzọ egbe.,"'Madụ ekwesighị imegide mmadụ ibe ya n'ụzọ ọbụla'- Umahi O kwuputara nke a mgbe ya na ndị ụlọọrụ gọọmentị Ebonyi steeti nwere nzụkọ n'Abakiliki n'ụbọchị satụde. Umahi jiri ohere a were kọwara ndị a etu ndị mmadụ siri gbochie ụgbọala ya igafe n'okporo ụzọ dị n'Ọnịcha. O kwuru sị na na-agbanyeghị ndị nchekwa ma ndị agha ha na ya so, ndị a achọghị ka ha gafee. Nke a mere ka Gọvanọ Umahi nye ndị nchekwa ya iwu ka ha nwuchie ndị niile nọchiri ya ụzọ. Ndị nchekwa nwere ikike igba onye nọchịri ụgbọala Gọvanọ egbe. O kwuru na ọtụtụ na ime ndị a gbara ọsọ ma na ọ dị kwa otu onye agha ha napụrụ egbe ya. Umahi kwuru na ndị nchekwa na ndị uweojii pụrụ iche na-agba mbo inwude ndị a niile. O kwukwara na mgbe a nwụdoro ha, na a ga-akpọta ha n'Ebonyi steeti ma tụo ha nga. Ọ bụ nke a mere ka Umahi si "" imu anya abalị maka ikwa ozu ga akwụsị n' elekere iri nke abalị site ụgbụa gawa n'ihu"". Gọvanọ Umahi kwukwara na mgbe ọzọ, ndị nchekwa ya pụrụiche nwere ikike igba onye ọbụla nọchịri ya ụzọ egbe n'ihi na iwu naijirịa kwadoro ya. O kwuru na-onye ga-anọfe elekere iri ga-enweta ikike sitere n'aka onyeisi okpouru ọchịchị ya kama ihe ọbụla mere ga-adị onye enyere ikike a n'isi. Ọ ga kwara n'ihu kwuo sị "" A chọrọ m ka agbasaa ozi a nke ọma maka na nsogbu m abụghị maka onwe m, kama ọ bụ onye nkiti na-agara onwe ya ndị a nwere ike iwakpo"". Lee akụkọ ga-amasi gị Lee ihe nkiri ga-amasị gị Ọka mmụta Boniface Igbenehue" egwuregwu-46710877,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46710877,Liverpool vs Arsenal: Onye ga-ehicha Iwobi na ndị otu ya anyammiri?,Ọ na-akpọtụ ebe niile maka etu Liverpool si were ọkpụ goolu ise asatara otu nyụọ Arsenal anya n'asọmpi Premier League taa.,"Ka onye ọbụla nọ n'ime mmụọ e ji agba ekeresimesi ma na-eche afọ ọhụrụ, ndị Arsenal anaghị enwetya onwe ha maka ""mkparị"" Liverpool kparịrị ha. Goolu atọ Roberto Firminho nyere na nkeji 14, 16 na 65, na nke Sadio Mane nyere na nkeji 32 nakwa nke Mohamed Salah ji penariti nye na nkeji 45 na ụma, kụnyere ntu dị n'akpati ozu ndị Arsenal. N'agbanyeghị na Arsenal bu ụzọ nye goolu si n'aka Ainsley Maitland-Niles na nkeji 11, o zughi ịzọpụta ha n'aka ihe mgbu Liverpool kwadoro ha n'ọgbọ egwuregwu Anfield. Mmeri Liverpool meriri Arsenal mere ka ha jiri pọịntị itoolu nọrọ n'elu tebulu Premier League. Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Otiegwu a ma dịka Ruggedman kwuru sị na obi ga-adị ndị Arsenal ka ha kwụọ ụdọ: @otoiks kwuru na Liverpool ji ụtalị pịakasịa Arsenal ahụ. @morakcares kwuru sị na ọ ga na-akwado Arsenal ma na mmeri ma mgbe e meriri ha." afirika-52158515,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52158515,Cronavirus: Lee mba ndị COVID-19 echetabeghi,Ọrịa coronavirus nke a na-akpọ COVID-19 na-eme njem na-agagharị mbaụwa dị icheiche mana ị ma na e nwere ebe ndị ọ tụbeghị ụkwụ ruo ugbua?,"Ịkwọcha aka bụ ụzọ kacha dị ire iji gbochie ọrịa coronavirus Ọrịa a batara Naịjiria n'ime izu ole na ole gara aga, egbuola ihe karịrị mmadụ puku 50 kemgbe o selitere isi na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ otu nde ebutela ya bụ ọrịa na mbaụwa, ebe ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ gbakerela. Mana ị makwa nke ekwe na-akụ nwanne? Ruo taa bụ abalị atọ nke ọnwa Eprelụ, e nwere mba ndị ejibeghi anya hụ kama otu onye bu ọrịa a. Ị na-ajụ mba ndị ọ bụ? Ngwa lee ka anyị kọwaara gị: Dịka BBC si chọpụta na ngụkọ mahadum Johns Hopkins mere, mba 18 n'ime mba 193 so n'otu mbaụwa bụ United Nations enwebeghi otu mkpụrụ onye bu ya bụ ọrịa. Mba ndị na-ebughi COVID-19: Anụbeghi akụkọ coronavirus na mba Nọt Koria, ihe a na-anụ ịtụ ogbunigwe 'nuclear' A na-atụ egwu na coronavirus ga-anyụ mba Nauru anya ma ọ baa ebe ahụ, n'ihi na ha bụ mba dara ụbịam. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-akọwa na o nwereike ịbụ na mba ndị a akpọpụtabeghi ọnụọgụgụ ndị bu ya; na ọ bụghị na enwebeghi ndị butere ya. Ndị ọzọ, ọkachasị ndị a bụ mba ndị nọ n'elu mmiri a na-akpọ aịlandị, nwereike ha ebutebeghi ya n'ihi na ha anaghị enwekarị ndị si esi abata mba ha (bụ etu ọtụtụ ndị mba ọrịa a na-enye nsogbu ugbua a si bute ya). Ụfọdụ mba ndị ahụ tere ezigbo aka nke bụ na mmadụ ga-eme oke njem tupu o rute ebe ahụ. Ihe dịka mba Nauru, machiri mba Chaịna, Saụt Koriya, Itali na Ịran ịbata na mba ha ka ọrịa a malitere. Ha kwụsịkwara ụfodụ ụgbọelu si mba ndị ọzọ ifetu na mba ha, dịka onyeisiala mba ha sịkwa na o ji ekpere na akwụkwọ nsọ echekwa mba ya. Ọrịa a ọ ga-emecha ruo ha aka? Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus Ndị ọkachamara na-ekwu na mmachi na mgbochi ha na-eme nwereike na-azọ ha ugbua, mana o nwereike ghara ịdịgịde. Maka gịnị? Andy Tatem, bụ ọkammụta sayensị na mahadum Southampton, kwuru na mba ndị a na-atụbatakwa ihe dịka nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Nke bụ na e gbochigide, oge ga-erukwa mgbe ha ga-achọ ịtụbata nri maọbụ ihe ndị ahụ maọbụ ibupu nke si mba ha. Mgbe ahụ ha ga-emepe okeala ha makwa bulie ụfọdụ mmachi a nke ga-eme ka ọrịa a nwee ohere ịmịbata. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Anyanwụ anaghị agwọ coronavirus" afirika-43991961,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43991961,Ị ma na ị daala iwu ma ị gbuo onye chọrọ ọnwụ na Naịjirịa?,Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa amaghị ikike ha nwere ịbụ mmadụ nakwa ịbụ onye a mụrụ na mba a.,"Ị ma ikike ị nwere iji eme etu ọbụla masịrị gị dịka onye Naịjirịa? Amaghị ikike a ebuterela ọtụtụ mmadụ nkwafu ọbara nakwa ịga nga mkpụrụ ọka. Ihe ndị dị ka etu gị na ndị uweojii si emekọrịta nakwa etu gị na ndị agbataobi gị si emekọrịta nwere ike ịzọ gị maọbụ tinye gị na nsogbu. Ndị otu na-ahụ maka oke ruru onye bụ Constitutional Rights Awareness and Liberty Initiative (CRALI) bukwasịrị ya onwe ha ime ka ndị Naịjirịa mata ikike ha nwere, nke mere ha jiri rụpụta ihe ga-akụziri gị ikike ndị a. Ha rụpụtara ihe ha kpọrọ ""know your rights Nigeria app"" nke ndị US Consulate dị na Naịjirịa kwadoro. E mere app a ka o nwee ike ikuziri ndị mmadụ ikike ha n'asụsụ ha ga-aghọta, nke gụnyere Igbo, Hausa, Yoruba, Pidgin nakwa bekee. Onye mepụtara ya bụ Adeola Austin Oyelade, kwuru na e nwere ndị ọkaiwu iri ise (50) ga-enyere gị aka ma zaa gị ajụjụ ọbụla ị nwere ịjụ n'elu app a, n'efu. Ị ma ikike ị nwere iji eme etu ọbụla masịrị gị dịka onye Naịjirịa? Ị ma Ikike gị? Ọtụtụ ndị mmadụ abanyela n'ime nsogbu ha na-amaghị etu ha ga-esi apụta maka amaghị ikike ha. Na Naịjirịa ị 'nyere mmadụ aka' gbuo onwe ya maka na ọ chọrọ ịnwụ tupu ọrịa ọ na-arịa egbuo ya, iwu weere ya na ị gburu mmadụ. Nke a ga-eme ka ị gaa mkpọrọ. Ị chọọ iji aka gị gbuo onwe gị nke bekee kpọrọ 'suicide' ma ị mezughị ya, iwu mara gị, ị nwekwara ike ịga nga otu afọ. Iwu Naịjirịa kwuru na a ga-eche ka nwaanyị ahụ mụọ nwa tupu e gbuo ya, maka na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ bụghị nwa ya. Lee ikike ndị ọzọ ị nwere: Ị ma ikike ị nwere dịka onye Naịjirịa? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:" afirika-44848674,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44848674,Ekiti: Fayose sị ihere kwesiri ime Buhari maka etu ntuliaka si gaa,"N'ihe gosiri na ikike ọchịchị agafeela n'aka onye ọzọ, ngalaba ndị na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ụgbọala n'Ekiti steeti hazigharị ndị na-achị ha taa n'Ado Ekiti, isi obodo steeti ahụ.","Ndị na-agba okada na-ekwu na ha chọrọ ịtụgharị ndị na-achị ha N'ọnụ ụtụtụ taa, ndị na-anya ọgbatụmtụm eji ""ọkada"" mara wuchiri ebe dị icheiche ngalaba na-ahụ maka ha nwere ụlọ ọgbakọ wee chụpụ ndị isi niile ha sị nkwadoro aka na-achị steetị ahu bụ Ayodele Fayose. Mgbe BBC ruru ọdọ ụgbọala dị na ebe akpọrọ ""Old Garage"" n'Ọja Ọba, Ado Ekiti, ndị ọhụru anọchịela ndị ochie. BBC hụkwara ọtụtụ okoroọbịa ji osisi na ngwa ọgụ ndị ọzọ na okporo ụzọ. Ààrẹ Buhari kí Fayẹmi kú oríire Etinyela ndị nchekwa si uweojii na ndịagha n'ebe maka igbochi ọgbaghara nwereike dapụta. Cheta na Kayode Fayemi bụbụrụ aka na-achị steeti ahụ, ma bụbụ minista na-ahu maka ihe a na-egwupụta n'ala, meriri Kolapo Olusola Eleka bu osote gọvanọ steeti ahụ ugbua na ntuliaka emere ụbọchị Satọde gara aga. Feyemi zọro ọchịchị n'aka ndị All Progressives Congress (APC) ka Fayemi zọrọ ya n'aka ndị Peoples Democratic Party (PDP). BBC gara Ekiti ịhụ etu ya bu ntuliaka ga-esi gaa, ma hụ na pati abụọ a bụ ndị aha ha na-ada ụda banyere n'ime ike ego maka ịzụta votu. Ọtụtụ mmadụ na-anwụrị maka mmeri Faeyemi Mana ugbua, ndị PDP ekwuola na ha anabataghị ntuliaka a. Ma kwuo na ha na-ahụ na ha nwere mmeri n'ikpeazu - bụ ihe ụfọdụ sị pụtara na ha ga-aga ụlọikpe ga zọọ mkpebi ya bu ntuliaka. Ugbua na soshal midia aka na-achị steeti ahu bụ Ayodele Fayose na-ebe akwa ariri were ebo onyeisiala Naịjiria bu Mohammadu Buhari na aka ya di na mmeri emeriri osote ya. Ọ gakwara n'ihu jụọ ihe mere ndị mmadu emeghị aṅụrịghị mgbe ozi pụtara na Fayemi meriri. Mana, BBC Yoruba hụrụ ndị mmadụ na-eme ngagharị aṅụrị ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijirịa bu INEC kwupụtara na Fayemi emeriela. Ndị ntaakụkọ BBC gara ọrụ n'Ekiti kwukwara na ọkachasị udo bụ ihe chịrị na ntuliaka a, agbanyeghi na o nwere ebe obele ọgbaghara chọrọ ime, mana ndị nchekwa mere ngwangwa gaṅụọ ya bụ ọkụ." egwuregwu-44183318,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44183318,Chelsea egosila Man Utd nkarị ma bulie iko FA,Chelsea emeriela Manchester United iji bulie iko FA bụ naanị iko ha nwetara n'afọ a.,"Penarity Eden Hazard nyere mere ka Chelsea nwee ike ibuli iko FA nke ugboro asatọ Eden Hazard bụ onye egwu ndị Chelsea gbakpuru penariti o nwetara, nke mechara bụrụ naanị goolu e nyere na ngwụcha asọmpi FA nke afọ a. A gufuru goolu Alexis Sanchez bụ onye egwu Arsenal nyere maka na ọ pụrụ 'offside'. Ogbu opi bụ Michaeel Oliver ji VAR mee nyocha mere e ji gufuo goolu a. Onye egwu ndị Manchesyer United bụ Paul Pogba, tafuru isi ọ tara n'ihu poostu, nke kara ime ka ndị otu ya sata goolu Hazard. O buru aka n'isi ka ọ hụrụ na ihe o mere enyereghị ha aka. Nke a bụ mbụ Jose Mourinho ga-eru ngwụcha asọmpi ma ghara ibuli iko kamgbe o ji bụrụ onye nchịkọta n'England N'agbanyeghị na Chelsea meriri ndị otu ya, Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Man Utd makọrọ Antonio Conte na-achịkọta Chelsea, ebe Mourinho rụburu ugboro abụọ. Chelsea bulikwara iko FA otu ugboro n'afọ 2006-2007 oge Mourinho bụ onye nchịkọta ha" afirika-47094401,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47094401,2019 Elections: Pati APC onweela ngalaba na mba Niger?,Ụmụ Naijiria akatọọla ọbịbịa ndị gọvanọ abụọ si mba Niger bịara Naijira maka achụmta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari.,"Gọvanọ Ganduje na ndị gọvanọ si Niger Ụbọchị Tọozde ndị gọvanọ abụọ si mba Niger, wuchiri na Kanọ iji nye achụmta vootu onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nkwado. Ndị gọvanọ a gụnyere, Issa Mousa nke steeti Zinder nakwa onye otu ya bụ Zakiri Umar na-achị steeti Maradi. Onye enyemaka gọvanọ Ụmar Ganduje nke Kano steeti n'okwu mgbasa ozi bụ Salisu Yakasai bụ onye gbara nke a n'anwụ site n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ya bụ @dawisu. End of Twitter post, 1 Yakasai kwuru, ´´H.E @GovUmarGanduje ya na osote ya H.E Dr Nasiru Gawuna, onye bụbuuru osote ya H.E Prof Hafiz Abubakar, Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime Abdurrahman Dambazau, nakwa nke na-ahụ maka mmiri, Suleiman Kazaure, ndị Gọvanọ si Zinder na Maradi nke Niger Republic, nakwa ndị ọzọ adịla njikere ịnabata @MBuhari #PMBinKano''. Onye enyemaka onyeisiala Naijiria n'okwu gbasara social media bụ Bashir Ahmad, site n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ya @BashirAhmad kwughachịkwara nke a. O kwuru, ''Ndị gọvanọ si mba Niger Republic e sonyerela onyeisiala Muhammadu Buhari na mmemme achụmta vootu ya na Kano''. Na nkọwa ya, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mba na mba, bụ Mazi Sam Olisa, katọrọ ọnọdụ a ma kọwaa ya dịka nke na-egosi na Naijiria agaghị enwe ntụliaka mago-mago na a gaghị adị na ya. na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere site n'ekwe ntị, ''Ọbụrụ na ndị gọvanọ si Niger abịa okwu achụmnta vootu ebe a, nke a na-egosi na ndị ha na-achị nwekwara ike ịbịa tụọ vootu ma oge ruo''. ''O gosikwara na ala Naijiria enweghị ezi nchekwa maka ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa''. Mazi Olisa gaziri n'ihu ma gwa ndị otu pati na anọghị n'ọchịchị ka ha mụrụ anya ka azụ, gbakwụnye na ''ọnọdụ e metụtala ọgụ Naijiria na-alụ kamgbe megide enweghị nchekwa''. Na ntụnye ya Mazi Ikechukwu na Twitter kwuru, ''Ndị Gọvanọ si Zinder na Maradi dị na Niger Republic na Ganduje adịla njikere ịnabata #PMBinKano. Ndịọrụ gọọmenti mba Niger nwere ike ịtụ vootu na Nigeria. Anyị ma na ndị Niger na-atụ vootu na mgbago ugwu. Akụkọ ga-amasị gị:" 49734138,https://www.bbc.com/igbo/49734138,Peter Obi's Economic Model: Ndị katọrọ atụmatụ Obi maka China amakụọla ya ugbua?,Aka chịburu Anambara Steeti bụ Peter Obi bụ okwu a kpụ n'ọnụ na soshal midia 'Twitter' n'ụbọchị Tuuzde.,"Peter Obi Nke a bụ n'ihi atụmatụ gọọmentị etiti wepụtara nke kwuru na ha ga-agbali iwulite akụnaụba Naịjiria dịka nke mba Chaịna. Okwu a mere ka ọtụtụ mmadụ cheta ihe Obi kwuru ọge a na-akwado maka ntuliaka nke onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ 2019. Obi na Abubakar Atiku so zọọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala n'aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party'. N'oge ahụ, Obi kwuru na ya Atiku ga-eme ka akụnaụba Naịjiria dị ka nke mba Chaịna ma ọ bụrụ na ha merie. Ebe ọbụla ọ gara ikwu okwu n'oge ahụ, Obi na-eji mba Chaịna eme ihe ọmụmaatụ. Nke a mere ka ụfọdụ ọtụmadị ndị otu APC gụnyere onyeisioche ha bụ Adams Oshiomole malite ịkpọ Obi 'Maazị Chaịna.' Ụfọdụ ha na-ekwu na Obi kwesịrị ikwu ihe gbasara Naịjiria hapụ Chaịna. Peter Obi tụru ka ọnwa n'ụlọikpe Mana dịka gọọmentị Muhammadu Buhari malitere ikwu okwu gbasara Chaịna ugbua, ndị mmadu na-ekwuzi na ihe Peter Obi kwuru mgbe gara aga bụ eziokwu. Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Mọnde na gọọmentị ga-ehibe ihe Bekee kpọrọ 'Special Economic Zones' na mpaghara isii nke Naịjiria dịka ọ dị na mba Chaịna. Lee ụfọdụ ihe ha kwugasịrị: @firstladyship nakwa @mydeji247 kọwapụtara Mana @otamssweet kwuru na ihe Zainab Ahmed kwuru dị iche na ihe Peter Obi kwuru. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Toilet Posture:Lee ka ị ga-esi ga mposi ọfụma na-achịghị nsị" afirika-48961685,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48961685,Presidential Elections: Ụlọikpe akụpụla ikpe na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala,"Akụkọ kachasị dị mkpa n'ụbọchị Fraide, abalị iri na abụọ nke ọnwa Julaị:","Uloikpe akụpụla ikpe na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Fraide kụpụ n'akụkụ, akwụkwọ a gbara na-ekwu na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala na ntuliaka 2019. Na mkpebi ụloikpe nke ọkaikpe atọ n'isi ya Jọstis Mohammed Idris kwuru na a gbara akwụkwọ ahụ mgbe ọ gaferela oge kwesịrị ka e weta ya bụ okwu n'ụlọikpe nke bụ abalị iri na anọ. Kalu Kalu, Labaran Ismail and Hassy El-Kuris gbaburu akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji gbaghaa na Buhari etozughị ịbụ onyeisiala. mana ụlọikpe ahụ kụpụrụ ya, ha were gbagharịa akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe mgbegharị. N'aka nke ọzọ, ""Ezipụrụm mpụtara ntuliaka gaa 'server'"" Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Onye ọrụ Inec ọzọ agbaala akaebe na ya zigara mpụtara ntuliaka 2019 na 'server' n'oge ntuliaka onyeisiala Naijiria e mere n'ọnwa Febuwari afọ 2019. Olufemi Ogunride, onye so na ndị ọrụ ngo Inec jiri rụọ ọrụ kwuru na ""Ihe m ma bụ na presiding Officer wetara akwụkwọ EC8C Form nke m lere anya were debanye akara site n'igwe 'card reader' banye na 'server'."" Cheta na otu pati PDP rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka e nye ha ikike inyocha 'server' dịka ha na-ebo ebubo na Inec nwogharịrị mpụtara ntuliaka 2019 iji nye Buhari mmeri. 'Nyeenu UNN nkwado imepụta ụgbọala latrik n'ụbara' Otu jikọrọ ndị ntorobia n'Ọwụwa-Anya a kpọrọ 'Coalition Of South East Youth Leaders' akpọkuola gọọmenti etiti ka ha nye mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nkwado ego iji emepụta ụgbọala latrik na-enye ọkụ n'ụbara. Mbeku a na-esote mmepụta ụgbọala latrik na-enye ọkụ nke Engineering Department nke mahadum ahụ mepụta na nsonso a. Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi Mbeku ahụ dị n'akwụkwọ ozi otu ahụ zitere BBC Igbo ụbọchị Fraide nke onyeisi ha bụ Goodluck Egwu Ibem binyere aka. Ha rụtụrụ aka mkpa ọ dị ka gọọmenti kwado mahadum na imepụta ụgbọala ahụ ka o juo eju bara abara na Naijiria nakwa maka mbupụ na mba ndị ọzọ. Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala Ha kpọkwara oku ka gọọmenti etiti nye mahadum'University of Nigeria Nsukka' ohere inwe ngalaba 'Chemical Engineering.' ""Na Naijiria e nwere mahadum ọkaibe nke mpaghara atọ; 'University of Lagos'(Unilag), 'Ahmadu Bello University' (ABU) na ""University of Nigeria Nsukka(UNN). Nke UNILAG na ABU na-akụzi Chemical Engineering mana e nyeghị UNN ohere ịkuzi Chemical Engineering."" ""Ihe ọbụla bụ ihe kpatara nke a, anyị na-akpọku gọọmenti ka onye ohere ka mahadum a bido kụziwe 'Chemical Engineering' iji kwado ọganihu teknụzụ na Naijiria."" Ogbunigwe egbuola mmadụ itoolu gụnyere nwatakịrị Ihe ọjọọ mere n'ofesi dịka ndị omekataraihepụọụjọ yinyere nwatakịrị ogbunigwe gburu mmadụ itoolu na mpaghara Nangarhar dị na mba Afghanistan. Ihe a mere ebe a gara agbamakwụkwọ merụkwara mmadụ iri na abụọ ndị ọzọ ahụ. Ihe mere n'ogige Pati PDP Akụkọ si n'ọnụ Ọkaiwu Livy Uzoukwu bụ onye du ndị ọkaiwu otu pati People Democratic Party (PDP) na-akọwa na ndị obu egbe wakporo ndị kwesịrị ịgbara Atiku Abubakar na Peter Obi akaebe n'ụlọikpe. PDP sị na ihe a mere ka Ọkaikpe Mohammed Garba yiharịa ụbọchị ikpe ha ruo Monde bụ ụbọchị iri na ise nke ọnwa a. Ndị Shịa nọ ụlọikpe Ndị uweojii Naịjirịa akpụpụla mmadụ iri isii na ise bụ ndị otu ofufe Shịa ụlọikpe dị n'Abuja maka ebubo mwakpo, ịkpa nkata mpụ nakwa ịgbakọ n'ụzọ ezighi ezi. A nwụchiri ha mgbe ha na-eme ngagharịiwe maka onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky gọọmentị etiti Naịjirịa ji eji. Griezmann agaala Barcelona Ndị na-akwado Barcelona amalitela ịkpa nganga dịka ndị isi ha gotere Antoine Griezmann. Griezmann so ndị France bulie Iko Mbaụwa n'afọ 2018 abụrụla onye isii ego e ji zụọ ya kacha dị ọnụ n'ụwa, dịka Barcelona kwụrụ paụnds otu nde narị na asaa iji gote ya. Ụnụ akwanyela m ọkụ n'ike Muhammadu Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na nnukwu ọkụ dị ya n'ike ugbua maka ịhọpụta ndị mịnịsta ga-eso ya rụọ ọrụ. Buhari kwuru nke a oge ya na ndị omeiwu ụfọdụ riri nri abalị ụnyaahụ n'Aso Rock dị n'Abuja. Ọ kọwara na ihe o ji dị ka ọ na-egbu oge ịhọpụta ndị mịnịsta bụ maka na ọ chọrọ ịhọrọ ndị ọ ma n'onwe ya na-abụghị ndị pati ya bu APC ga-ahọpụtara ya. A na-ele anya na Buhari ga-ewepụta aha ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka Minista. Lebanụ anya na nkwekọrịta confrensị 2014 Goodluck Jonathan kwuru na oge adịghịrị ya itinye nkwekọrịta confrensi 2014 n'ọrụ. Aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan ka na-ekwusi ike na nsogbu Naijiria niile ga-ala kpam kpam ma ọ bụrụ na e mee ihe niile ekwekoritara na ọgbako confrensi nke 2014. Jonathan kwuru nkea n'otu ọgbakọ na Legọs unyaahụ bụ abalị iri na otu nke ọnwa Julaị. Ọ kọwara na mgbe emechara ya bụ ọgbakọ na 2014, oge adighịrị ya iji tinye nkwekọrịta ndị ahụ n'ọrụ n'ihi na oge ntuliaka atụnyela n'ụkwụ. Trump agbaala isi akwara A na-atụ egwu na Trump nwere ike iji atụmatụ ọgụgụ ọnụ 2020 wee mee nrụrụaka mgbe ntuliaka ga-ebido Na mba ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na ọchịchị ya ga eso ụzọ ọzọ iji chọpụta mmadụ ole bi na Amerịka bụ ndị si mba ọzọ wee bịa. Ụlọikpe ukwu Amerịka machiri Trump itinye ajuju gbasara obodo mmadụ si mgbe a ga-eme ọgụgụ ọnụ nke afọ 2020. Mana Trump na ndị pati ya bụ 'Republicans' kwuru na ha ga-esi ụzọ ọzọ wee nweta ọnụọgụgụ ndị mbiara mbiara ole bi n'Amerịka maka na ahụghị ka e mere, e mee ka a hụrụ. Naijiria na Ọljiria Samuel Chukwueze nke Naijiria na Riyad Mahrez nke Ọljiria N'egwuregwu bọọlụ, ọ ga na-ada ""jiria jiria"" ụbọchị ụka mgbe Nijiria ga-ezute Ọljiria n'agba abụọ nke ikpeazụ nke asọmpị iko mba Afrịka. Mba Ọljiria jiri ọkpụ goolu penariti anọ asatara atọ wee dulaa ndị Aịvọrị Kost ụnyaahụ. Iji wulite mmụọ ha, ndị ogaranya abụọ bụ Aliko Dangote na Femi Otedola ekwela ndị Super Eagles nkwa ibunye ha ego n'ụkpa ma ha merie ya bụ asọmpi. Mba Senịgal ga-ezute ndị Tunisia na asọmpi 'semi-final' nke ọzọ. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49276182,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49276182,Senator Utazi: Ihe mere m ji hapụ ike akụrụngwa 'Constituency Project' mgbe o kwesịrị,Omeiwu na-anọchịte anya Enugwu Nọt bụ Godfrey Chukwuka Utazi azarala ọnụ ya maka ebubo ngalaba na-ahụ maka nrụrụka na mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) boro ya.,"Okwu Senator Utazi banyere Constituency Project ICPC kpọchiri be Utazi n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọstụ, ma bo ya ebubo na o buuru akụrụngwa gọọmentị so n'ihe Bekee kpọrọ ""Consistuency Project"", dowe na be ya ghara ikenye ya ndị mmadụ etu o kwesịrị. End of Twitter post, 1 ICPC gakwara n'ihu gosi foto ha sị si be Utazi, nke ha sị na-egosi akwụrụngwa ndị a. Ka ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ na ya bụ foto na ebubo ndị ICPC, akụkọ ọzọ pụta na Sinetọ Utazi amalitela ike ya bụ akụrụngwa. BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ maka ebubo a. Sinetọ Utazi malitere okwu na ịsị na ọ bụ ndị iro na-agba ya mgba okpuru butere okwu a. Ọgbatumtum a hụrụ na be Utazi Ọ sị na nke a bụ ugboro atọ ọ ga-eme atụmatụ ""Consistuency Project"" kemgbe ọ banyere ọkwa dịka onye omeiwu. ""Ihe mere na m ekeghi nke a n'afọ gara aga bụ na m chọrọ ike ya mgbe ezumike m. Achọghịkwa m ike ya mgbe ndọrọndọrọ ka ndị mmadụ ghara iwe ya na m chọrọ iji ya zọta vootu."" Sinetọ Utazi gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị nwere ọrụsị ka ha na-ekenye ha bụ akụrụngwa. ""Anyị malitere ike ya kemgbe Tusde. Ọ ga-ebi na Monde na-abịa."" Igwe na-enye ọkụ latrik so n'ihe ICPC hụrụ na be Utazi Osita Enwe bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye Enugwu Nọt gwara BBC Igbo na ya bụ okwu bụ ihe ekwesịrị ime nnyocha ọfụma makana akụrụngwa a na-ekwu okwu ya bụ ego gọọmentị ka e ji gote ya. ""Anyị nụrụ na ICPC kpachiri ụlọ ya, ma nụkwa na ọ na-ekezi ihe a hụrụ na be ya. Ọ bụ ihe mgbagwoju anya. makana etu o si eke ugbua nwereike ịbụ oke na-agba ọsọ makana ọkụ na-agba."" BBC Igbo jụrụ Sinetọ Utazi ma ọ bụ ICPC manyere ya ike akụrụngwa a. Ọ jụrụ: ""Ọ bụ ICPC manyere m ike nke afọ gara aga, kaọbụ nke anyị kere n'Epụrel?"" Utazi zụtakwuru ụgbọala ụkwụ atọ a na-akpọ Keke maka ""constituency project"" ya BBC Igbo gbakwara mbọ ịnụta n'ọnụ ICPC mana ekwentị ha agaghị. Enweghikwanụ ihe ha dere maka okike akụrụngwa n'akara soshal midia ha maọbụ na webụsaịtị ha. Gee ihe Sinetọ Utazi kwuru n'uju n'elu. Ihe nkiri ga-amasị gị: Sinetọ Mao Ohuabunwa kọwapụtara ihe kpatara o jiri nye ndị ọ na-anọchite ite eji eghe ihe" 47744006,https://www.bbc.com/igbo/47744006,Nnamdi Kanụ: Ihe iri dị mkpa onye ndu Ipob kwuru n'ozi ọhụrụ,"Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob, ekwuola na iwu Jọstis Binta Nyako nyere ka a nwụchie ya ọzọ bụ mgba megide ịkpemkwụmọtọ.","Kanu onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abali Tọzde, na mba Briten tụrụ arịrị sị ""Mkpebi sị n'ụlọikpe megidere ikpemkwụmọtọ, megide nhatanha."" O si na ""mkpebi Nyako bụ iji gbodo aja n'inyocha ihe mere na September 14,2017 mgbe ndị agha wakporo ụlọ m bu ihe butere na ya anaghị abịa ụlọikpe."" O tikwara mkpu sị na a na-akpagbu ndị Biafra, ndị Ipob na yanwa bụ onye ndu ha. Lee okwụ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru: 1. Ihe mere m ji eme mgbasaozi ntụmadị a bụ n'ihi ka ihe si aga 2. A na-agba izu megide Ipob, a na agba izu megide Biafra, a na-agba izu megide mụ onwe 3. Mana ihe ọbụla ha kpara agaghị adị ire n'ihi na Chukwu okike Abịama m kwụnyere anyị. 4. Biafra-abịa na mmezu ,anyị ga-ekele gị Chukwu Okike Abiama maka nke a 5. Ndị iro Biafra ga-ada, ha agaghị ebilite ọzọ 6. Anyị ga-ebido isiọrụ anyị n'Israel, nke abụghị na anyị ga-emechi ụlọọrụ anyị dị na Brussel 7. A na m ahụta ibu arọ ndị otu anyị nakwa ndị na-akwado anyị na-agabiga. Ibu arọ ndị a gụnyere ọnwụ 8. Jostis Binta Nyako kposara mgbapụta n'ụlọmkpọrọ e nyere m n'enyochaghị ihe mere na m apụtaghị n'ụlọikpe 9. Ka anyị ghara ịkpọ ganịganị n'ihu ndị iro anyị. 10. Ka anyị gaa n'ihu n'jem anyị rua ala e kwereanyị na nkwa. must continue this very noble march to that promiseland.""" afirika-56061613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56061613,"Anglican Priest Julius Dike:' Ọnọdụ m hụrụ ha, gosiri na o nwereike ịbụ nsị gburu ụkọchukwu, nwunye ya na nwanne m nwaanyị'","Eze Nwachukwu ekwuola ihe o ji anya hụ dịka o nwetere ozi maka ọnwụ nwanne ya nwaanyị Joy, ụkọchukwu Julius Dike na nwunye ya, Agnes Dike.","O kwuru na ọ hụrụ nwanne ya nwaanyị ka ọ tọgbọrọ n'ala, hụ ozu nwunye ụkọchukwu ebe ọ tọgbọ n'ụlọ mposi nakwa hụ ozu ụkọchukwu Julius n'elu akwa ndịna ya. Nwachukwu kwuru na ọnọdụ a ọ hụrụ ha gosiri na o nwereike ọ bụrụ nsi ka ha riri. O kwuru na anya ikpeazụ ọ hụrụ nwanne ya nwaanyị bụ mgbe o were ego na-enya ya ka o nyere ya mama ha. Nwachukwu kwuru na ụkọchukwu Julius Dike ji ụmụ anọ, otu n'ime ha so ya na ndị ọzọ bụgara ozu nne na nna ya n'ụlọ ozu ka ahụchara ozu ha. O kwuru na ha na ụkọchukwu Julius bụ ezigbo ọyị mere nwanne ya nwaanyị ji ga-anọyere ya dịka ọ si eme na mbụ. O kwuru na ha na-eche nyocha dọkita nke bekee kpọrọ 'autọpsy' ka ha mara ihe gburu ndị a. Cheta na ndị uweojii nọ n'Abia steeti na-ekwu na ha ka na-eme nyocha ịji mara etu ọdachị a si mee. Etu ụkọchukwu Anglican Julius Dike, nwunye ya nakwa onye enyemaka ha si nwụ ka ha kachara ụka Ụlọ ụka abụghi nke awakporo Ndị mmadụ ka na-akwa arịrị maka etu Archdeacon Julius Dike bụ onyeisi nchụaja na St. Paul's Anglican Church, Abayi, Ariaria dị n'okpuruọchịchị Abia North, nwunye ya na onye ọzọ si nwụ ka ha kachara ụka abali fotere ụbọchị ọnwụ ha. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ebugala ozu mmadụ atọ a n'ụlọ ozu mana ha ka na-enyocha ka ha mara ebe mmiri si ba n'opi ugbọgịrị. O kwuru na ọ bụ site na kepu kepu ka ha si mata na udiri ihe a mere makana ndị mmadụ gwara ha na mgbe ha lere anya ụkọchukwu n'ụtụtụ ibia kara ha ụka , ha ahụghị ya, nke mere ka ha gawa bee ya, kugide aka ma gbawa ụzọ huzie ozu ha atọ ebe ọ tọgbọọ. Ogbonna kwuru na ebe ọ bụ na mmadụ atọ bi n'ụlọ nwụchara otu mgbe , ọ ga-arahụ i si na ọ bụ ihe a mere ha, ya bụ na ha ka na-eme nyocha ihe niile ha nwerike inyocha iji chọpụta etu ọdachị a si mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Chioma Inyang: Ihe mere m ji were ankara kwaara onwe m uwe agbamakwụkwọ" afirika-49275689,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49275689,Ibrahim EL-Zakzaky: Ndị otu IMN ebola gọọmentị Kaduna ebubo igbu ya,Ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) ekwuola sị na gọọmentị Kaduna steeti wepụtara atụmatụ a iji gbuo onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky.,"Ha kwuru nke a ka aka na-achị steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai wepụtara akwụkwọ iji kwuo ihe ha chọrọ tupu El-Zakzaky enwee ike gaa India nata ọgwụgwọ. Ha boro gọọmentị ahụ ebubo iwepụta atụmatụ a naanị iji emegide ma gbuo El-Zakzaky ka ọ nọ na nwụchi. Ha kwuru na ha anabataghị ya bụ ọnọdụ. Gọọmentị Kaduna steeti kwuru na ha chọrọ ka e lebanye anya tupu El-Zakzaky agaa India ịnata ọgwụgwọ dịka ụlọikpe nyere ya ikike. Dịka a gbara El-Zakzaky akwụkwọ n'ụlọikpe dị na Kaduna steeti, gọomentị obodo ha sị na ha achọghị akụkọ na e jikwa gbagbuo nwa nnụnụ nne ya efelie mgbe ọ ga-aga ụlọọgwụ. Ha kwuru na ha anọchighikwa onye ọbụla ụzọ ịnata ọgwụgwọ ahụike na mba ọbụla dị n'ụwa a ebe ọ bụ na onye ahụ na-akwụ ụgwọ ya. Ugo Egbujo bụ ọkaiwu ọnụ na-eru n'okwu gwara BBC Igbo sị na ndị gọọmentị Kaduna steeti "" kwesịrị ịkọwa etu ha chọrọ iji elebanye anya n'ọpụpụ na mbata ha makana ụlọikpe nyere ha ikike ahụ"". ""Ha eleela anya sị lekwa etu a ga-esi eme ya 'a ga-eme ya etu a mee ya etu a'. Etu a ha si depụta ya, onye na-ekwuchitere ndị otu El-Zakzaky bụ IMN ga-ele akwụkwọ ahụ anya. ""Ọ bụrụ na o chee na ndị Kaduna steeti na-emegide ha, o were ya gaa n'ụlọikpe ahụ, ebe ha ga-anọ ekwu ma ọnọdụ niile ahụ ndị Kaduna wepụtara eziri ezi maọbụ na o zighi."" Cheta na a nwụchiri El-Zakzaky n'afọ 2015 El-Zakzaky na nwunye ya bụ Zeenah Ibrahim kwesịrị ịga n'ụlọọgwụ Medanta dị na mba India, ebe ụfọdụ ndị gọomentị ga-eduga ha ịhụ na ha erighi mbombo ọsọ. N'okwu El-Rufai tinyere na Facebook, Samuel Aruwan bụ kọmishọna na-ahụ maka nchekwa obodo na steeti ahụ kwuru ebumnuche ha. Ihe asaa gọomentị Kaduna steeti chọrọ tupu El-Zakzaky agawa njem ya: Ha gakwara n'ihu kọwaa ihe butere nwụchi a nwụchiri El-Zakzaky na nwunye ya n'afọ 2015. Gụọ ihe o dere ebe a: Cheta na ụlọikpe nyere iwu sị ka a hapụ El-Zakzaky ka ọ nata ọgwụgwọ n'India n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium" egwuregwu-44565372,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44565372,World Cup 2018: Messi ebee ka Kroeshia gbara ha 3-0 iji gosi ha nkarị,Kroeshia enwetala mmeri abụọ n'asọmpi a ka ha ji goolu atọ merie Ajentina.,"N'ọgbọ egwuregwu Nizhny Novgorod, ndị n'ọchị ndị n'akwa ka ndị Kroeshịa meriri Ajentina. Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba. Kroeshia ji 2-0 merie Naịjirịa, mana ha tụkwasịrị ya otu taa ka ha meriri Ajentina. E gbuchiela bọọlụ. Ajentina achịtaghị aja ka Kroeshia gosichara ha nkarị. Nkeji 90 na ụma: Kroeshia ewepụla Mandzukic tinye Corluka. Ogbu bọọlụ nyere Brozovic akwụkwọ edo edo. Nkeji 90 na ụma: GOOOOOOLLLLUUUU! Rakitic agbakaala neetị ndị Ajentina. Nkeji 90: Messi ebutela bọọlụ n'ihu poostu ndị Kroeshia, mana isi apụtaghị. Nkeji 86: Ogbu bọolụ enyela Acuna akwụkwọ edo edo. Nkeji 85: Ogbu bọolụ enyela Otamendi akwụkwọ edo edo. Nkeji 84: Ọgụ achaala ka Otamendi gbaturu Rakitic ma gbakwaa ụkwụ ka o dina n'ala. Nkeji 82: Kroeshia ewepụla Perisic tinye Kovacic. Nkeji 80: GOOOOLUUUUU! Modric agbakaala neetị ndị Ajentina Rakitic na-akpakwa ike n'egwuregwu a. Nkeji 75: Rakitic adaala n'etiti ọgbọ egwuregwu. Ndị ọzọ gbarala bọọlụ na-aga, mana ogbu bọọlụ mechara gbuo bọọlụ. Ọ pụrụ ga nata nleta mana ọ batala. Nkeji 73: Strinic agbatuola Messi, ogbu bọọlụ enyela Ajentina 'free kick', mana efe enyeghị. A ka na-ekwu okwu goolu Caballero mere ka Kroeshia nye ha Nkeji 68: Ajentina ewepụla Perez tinye Dybala. Nkeji 67: Ogbu bọọlụ enyela Vrsaljko akwụkwọ edo edo. Nkeji 65: Mandzukic enyechakwaala goolu ugbua mana bọọlụ gara n'akụkụ neetị kama ibanye ya n'ime. Nkeji 64: Messi na Meza agbaala bọolụ gara nso neetị mana ọ banyeghị. Nkeji 63: Ndị Kroeshia na-acha ndị Ajentina ọkụ dị egwu. Nkeji 58: Ogbu bọọlụ enyela Mandzukic akwụkwọ edo edo. Nkeji 57: Kroeshia ewepụla Rebic nyere goolu, tinye Kramaric. Nkeji 56: Ajentina ewepụla Salvio tinye Pavon. Nkeji 54: Ajentina ewepụla Aguero tinye Higuain. Nkeji 53: GOOOOOLLLUUUU!!! Rebic agbakpuola goolu na neetị ka Caballero bunyere ya bọọlụ n'ihu neetị ya. Nkeji 51: Enyela Mercado akwụkwọ edo edo. Nkeji 49: Bọọlụ kụrụ Modric n'aka na-amaghị ama, mere ka ogbu bọọlụ nye ndị Ajentina 'free kick'. Nkeji 48: Salvio ebutela bọọlụ na-achọ Messi maọbụ Aguero, mana Vida bu ụzọ bute ya ma bughachịrị ya Subasic. Nkeji 46: Ọkara nke abụọ ebidola. Enyebeghị goolu ọbụla n'egwuregwu a. Ogbu bọọlụ egbuchiela ọkara a ka ndị mmadụ gaa ezumike nkeji 15. Nkeji 45: Rebic ebutela nri chinyere, mana ọ gbafuru ya n'elu neetị Caballero. Nkeji 45: Ogbu bọọlụ etinyela nkeji abụọ. Nkeji 44: Agbatuola Vrsaljko mana ogbu bọọlụ enyeghị onye ọbụla akwụkwọ edo edo. Nkeji 43: Onye ga-ebu ụzọ enye goolu n'guwregwu a? Otu abụọ a erichaala ohere ọma gaara abụ ezigbo goolu. Nkeji 39: Rebic enwetala akwụkwọ edo edo. Nkeji 38: Mascherano agbaala 'free kick' ha nwetara, mana Subasic ghọrọla bọọlụ ahụ n'ihu poostu ya. Nkeji 36: Mercado na-enweta nleta ka ya na Rebic sukọtara onwe ha n'ihu poostu ndị Kroeshia. Nkeji 32: Mandzukic atafuola bọọlụ ezi n'ihu poostu ndị Ajentina. Nkeji 29: Perez agbafuola bọọlụ n'agbanyeghị na ọ bụ naanị ya na poostu nọ maka na Subasic anọghị n'ihu poostu ya. Nkeji 27: Meza agbafuola bọọlụ n'kụkụ neetị ndị Kroeshia. Nkeji 26: Aguero ebubala bọọlụ n'ihu poostu Kroeshia, mama ọ pụrụ 'corner'. Ha gbara ya bụ 'corner' mana isi apụtaghị. Nkeji 21: Acuna gbara bọọlụ kụrụ Vida ma gafere ihu neetị ma bie n'igwe poostu. Nkeji 20: Mandzukic ebutela bọọlụ Caballero chọrọ inye Tagliafico n'ihu poostu ndị Ajentina!!!. Mana naanị 'free kick' ka ọ pụtara. Nkeji 18: Tagliafico na Otamendi na-anwa ike ha, mana bọọlụ adapụla ezi. Ka a tụbatara ya, Messi butere ya ma buru ya gaa n'ọkara ndị Kroeshia, mana Mascherano gbaturu Modricc mere ka Kroeshia nweta 'free kick'. Nkeji 12: Messi ebutela bọọlụ gbaa shọọtụ mana ọ gbara ya n'aka Subasic. Nkeji asaa: Mandzukic na Otamendi akụkọtala onwe ha ka ha abụọ chụrụ bọọlụ na-aga, mere ka Otamendi nweta 'free-kick'. Isi apụtaghị ka ha gbara ya. Nkeji anọ: Perisic agbaala shọọtụ na neetị, mana Caballero kụpụrụ ya 'corner'. Otu nkeji: Egwu ebidola n'ọgbọ egwuregwu Nizhny Novgorod. Onye egwu ndị Ajentina bụ Di Maria ebidoghị bọọlụ, ọ nọ n'oche ndị enwere ike iwebata ewebata. Ndị nọ n'oche Kroeshia: Josip Pivaric, Vedran Corluka, Dominik Livakovic, Marko Pjaca, Lovre Kalinic, Tin Jedvaj, Mateo Kovacic, Andrej Kramaric, Duje Caleta-Car, Filip Bradaric, Milan Badelj Ndị nọ n'oche Ajentina: Franco Armani, Paulo Dybala, Ever Banega, Cristian Ansaldi, Marcos Rojo, Lucas Biglia, Gonzalo Higuain, Ángel Di Maria, Federico Fazio, Nahuel Guzman, Giovani Lo Celso, Cristian Pavon Ndị Kroeshia bidoro bọọlụ: Danijel Subasic; Domagoj Vida, Ivan Strinic, Sime Vrsaljko, Dejan Lovren; Marcelo Brozovic, Ivan Perisic, Ivan Rakitic, Luka Modric, Ante Rebic; Mario Mandzukic Ndị Ajentina bidoro bọọlụ: Willy Caballero; Nicolas Tagliafico, Nicolas Otamendi, Gabriel Mercado, Eduardo Salvio; Javier Mascherano, Enzo Perez; Maximiliano Meza, Lionel Messi , Marcos Acuna; Sergio Aguero" afirika-43208187,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43208187,Gọọmentị agaghị akwụnwụ ụgwọ onwa ọhụrụ - NLC,Otu na-ahụ maka ndị ọrụ n'ala Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress na-eme mmemme eji mụpụta ha n'arọ 1978.,"Ndị ọrụ Naijirịa na-ejị May 1 eme emume mba ụwa niile ji echeta ha. Maka ihe a, minista na-ahụ maka ọrụ aka na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị na-akwado ị gbasa ozi gbasara ụgwọ ọnwa pekampe ọhụrụ na Naịjirịa. N'oge gara aga, gọọmenti kwuru na ụgwọ ọnwa ọhụrụ nkea ga-abụ puku naira iri ise na isi. Mana ndị ọrụ gọọmentị BBC kpọrọ n'elu ekwenti, ekwetaghị na gọọmentị ga-akwụ ugwọ nke a. Gere ihe otu n'ime ha gwara anyị: Onye ọrụ Naịjirịa Onye ọzọ n'ime ha na chọghị ka anyị deputa aha ya gwara onye nta akụkọ anyi na onweghị steeti gọọmentị nwere udi ego ahụ ị kwụ ndị ọrụ udị ụgwọ onwa ahụ ""Ha na-ekwu na ihe a bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha nwee ike ị nweta ntụlị aka ndị mmadụ"". Onye ọrụ gọọmentị n'Imo steetị bụ Nzeocha Simeon kwuru na ya bụ ụgwọ ọnwa ọhụrụ a gaghị ezu onye ji ezinụlọ ka ya. O na-ayo ka ego a bụrụ narị puku 100 maka ahụhụ na ọnọdụ obibi ndụ esiela ike. Dr Achu Amadị bụ onye ọrụ gọọmenti lagoro ezumike nka kwuru na otu na-ekwuchitere ndị ọrụ na Naijirịa akpọrọ 'NLC' anaghị eme ọfụma. Ọ sikwa na ha kwesiri ịhụ na ya bụ nkwa gọmmentị kwere maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ bụ ihe biara na mmezu. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ṅomie ndị ibe ha nọ na mba ọzọ n'ụzọ ziri ezi." afirika-51306628,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51306628,"Buhari Resign: 'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe",Ọnụ na-ekwuchitere Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom azaghachila okwu Garba Shehu kwuru maka ọkwa Abaribe mara ka Onyeisiala gbaa arụkwaghịm.,"Maazị Abaribe sị na ihe butere ya bụ ọkwa bụ maka etu nchekwa obodo Naijirịa siri kụọ afọ n'ala. Kama, onyeisiala Buhari sitere n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Shehu zahachi ya, were sị - na ụfodụ ndị na-ekwu ka Buhari pụọ n'ọchịchị abụghị na ọ bụ uche ndị Naijirịa niile. Gụọ ihe o kwuru n'ụjụ ebe a. N'ịza ihe o kwuru, Awom sị ""agaghị ewetu okwu a ala maka na o rughi Garba Shehu ọnụ"". Garba Shehu sị na Abaribe kwesiri ịga nga Ọ kọwakwara na ọ bụ ihe Sinetọ Abaribe kwesịrị ime ka o mere dịka onyeisi ndị omeiwu na-anọghị n'ọchịchị. Ọ sị ""ọrụ ya dịka onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ igosi gọọmenti ebe ha riri mperi."" O kwuru na ihe kacha dị Abaribe mkpa bụ nchekwa ndụ na akụnaụba ndị Naijirịa niile. Ihe o kwuru dịka Shehu rụtụrụ okwu Nnamdị Kanu aka Awom sị na okwu Nnamdi Kanu bụ ihe dị n'ụlọikpe, ""Shehu ekwesịghị itinye ọnụ n'okwu dị n'ụlọikpe"". Dịka ụlọikpe kwuputara atụmatụ maka ụgwọ mgbapụta Kanu, Awom kwuru na Abaribe mere ihe o kwesiri ime dịka onye Igbo. O kwukwara sị na ha agaghị ekwu maka okwu Kanu n'ihu Shehu maka na Shehu abụghị ụlọikpe. Ọ bụghị taa ka Abaribe bidoro ikwu maka ihe ndị Naịjirịa na-agabiga, ọkachasị ebe o metụtara nchekwa, dịka na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere. Ndị Igbo na Naịjirịa: Ihe Abaribe kwuru maka ọnọdụ ndị Igbo na Naijirịa Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a: Ọtụtụ ndị mmadụ kwuputara obi ha maka ọkwa a mara ka onyeisiala gbaa arụkwaghịm, lee uche ha: Tosin Olugbenga chetara ihe gọọmentị Buhari kwuru mgbe ha banyere n'ọchịchị. Leesi Barivole sị ""Dịka anyị kwadoro #justiceForChima, ka anyị kwadokwa #BuhariResign"". Adeparusi Adebayo sị ""ọzọ e bo Abaribe ebubo nrụrụaka"". Baba Alhaji sị na Abaribe kwesịrị ịnọ na nga. Akụkọ ga-amasị gị" 43054703,https://www.bbc.com/igbo/43054703,Champions League: Tottenham na Juventus agbaala abụọ abụọ,Tottenham na Juventus agbaala abụọ abụọ na asọmpị iko Champions League ụnyahụ.,"Gonzalo Higuain nyere goolu kacha ọsọ na asọmpị Champions League Mana Juventus bụ ndị mbụ nyere goolu abụọ, tupu Tottenham esi azụ nyekwa goolu abụọ nke a. Gonzalo Higuain bụ onye jịrị penalty nye goolu abụọ na ọkara nke mbu. Mana oge etebeghị tupu, Tottenham bido ị tụ Juventus n'anya. Harry Kane enyeela goolu asaa n'ime asọmpị Champions League n'afọ nke a Harry Kane bụ onye mbu nyere goolu ndị otu Tottehnam na nkeji 35. Na nkeji 37, Christian Erikson nyere goolu nke abụọ nke otu Tottenham. Tottenham o ga-enwe mmeri? Ugbua, onweghị onye merịrị Tottenham na asọmpị nke 13 ha gara na Champions League. Ha ka nọ n'asọmpị iko FA, bụrụkwa ndị na-achọ ị ba n'otu ndi anọ nke elu n'iko Premier League. Onye nkwuzi Tottenham bụ Mauricio Pochettino kwuru na ""Anyi kwesịrị ị nwe mmerị n'asọmpị nke a mana ndị otu m emeela nke oma""" afirika-51536487,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51536487,BBC Igbo agbaala afọ abụo... Ụnụ aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa,"Onye nwere opi, ya gbuo, onye nwere mkpọnala, ya gbaa, BBC Igbo agbaala afọ abụọ.","Oge Zoro na Chris Okagbue bịara leta BBC Igbo Taa bụ abalị iri na itoolu nke ọnwa Febrụwarị ka o mere afọ abụọ anyị malitere mgbasa ozi. N'ime afọ abụọ a, BBC Igbo egosila na anyị bụ ekwuchaa ọgwụ n'ezie. Ọ bụ akụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị, ka ọ bụ akụkọ ọdịnala Igbo, ka ọ bụ egwuregwu, ka ọ bụ akụkọ ịkpa obi ọma, BBC Igbo zuru ka e mee. Lee ọtụtụ akụkọ dara ụda anyị tipụtara n'ime otu afọ gara aga. Ndọrọndọrọ ọchịchị BBC Igbo kwụ chịm oge e mere ntuliaka iji họpụta ndị gọvanọ ọhụrụ nke afọ 2019. Anyị haziri nrụrịtaụka (debate) na steeti Abia, Ebonyi na Imo, nke bụ nke mbụ a na-eme n'asụsụ Igbo na Naịjiria niile. Ngwa kụpụrụ anyị aka ozugbo. Anyị gakwara n'elu, n'ala na ụwa niile ịhụ na anyị wetere ntuliaka ka o si gaa na steeti niile dị n'ala Igbo. Anyị nọ mgbe a gụpụtara mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, n'Abịa steeti, Enugwu steeti nakwa n'Ebọnyị. Oge ụlọikpe kachasị kụchapụrụ gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo steeti ma tinye Hope Uzodinma, BBC wetara ya n'uju. Anyị gakwara kpọtụrụ Emeka Ihedioha ka ọ gwa anyị ka obi dị ya n'ihi ikpe ahụ. Ihe gbasara Biafra Anyị gakwuru Nnamdi Kanu na Lọndọn mgbe ọ pụtara na nzuzo, ebe o kwuru ihe ndị gụnyere etu Nnamdi Azikiwe si tinye ndị Igbo na nsogbu. Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya Marakwa na anyị gbara ọkụ na steeti niile dị n'ọwụwa-anyanwụ ụbọchị e mere emume ncheta mbido agha Biafra nke a na-emekarị n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee. Na Jenụwarị nke afọ 2020, BBC Igbo so mee ncheta afọ 50 nke ụbọchị agha Biafra biri. Anyị si n'ọnụ ụmụnwaanyị hụrụ agha, ụmụaka hụrụ agha nakwa ndị ọzọ lụrụ agha nụ akụkọ etu agha Biafra a si gaa. O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme Ndị Igbo na-agba mbọ! Ọgba mbọ: ""Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa"" A chọwa ndị na-akwalite ndị Igbo na-agba mbọ, ndị mbụ a ga-akpọ bụ BBC Igbo. Anyị wetaara gị akụkọ onye isi na-arụ Njinia, onyeisi na-eme achịcha bekee, na nwaanyị na-arụ mesịn. Ndị ọzọ gụnyere ụmụnwaanyị na-akpụ ụzụ, ọkaiwu na-eme ọkpa, ọkaiwu na-akwa akwa, nwata nwaanyị na-eko bọọlụ o ji azụ onwe ya n'akwụkwọ, dịrị gawazie. Ọtụtụ n'ime ndị a enwetala enyemaka n'ụzọ dị icheiche n'ihi akụkọ BBC Igbo mere maka ha. Anyị gakwara ụlọọrụ ụgbọala Innoson, nakwa ụlọọrụ 'Erisco Foods'. Akụkọ egwuregwu I chetara mgbe C. Ronaldo dọriri ndị Atletico Madrid n'asọmpi 'Champions League', ka ọ bụ mgbe a gwọrọ Chelsea ka abacha. Kedụ maka mgbe a bọkasịrị Manchester United ka ọkụkọ 'Easter', ka ọ bụ mgbe a ṅụrụ Arsenal ka 'akpụrụ achịa'. BBC Igbo aghọọla ọkaibe n'akụkọ egwuregwu na Naịjirịa. Oge ọbụla e nwere egwuregwu gbara ọkpụrụkpụ, ndị mmadụ na-eche ka BBC Igbo tipụta isi akụkọ ya bụ egwuregwu. BBC Igbo kwụ chịm ị na-ewetara gị akụkọ egwuregwu n'ụzọ pụrụ iche na-atọkwa ọchị. Akụkọ ọdịnala Akụkọ asụsụ na ọdịnala Igbo anaghị akọ akọ na BBC Igbo. N'ime otu afọ gara aga, anyị kọwara etu e si nweta aha ahịa anọ ndị Igbo na-azụ, usoro edemede mgbe ochie bụ nsibidi, nakwa egwu dị icheiche e ji mara ndị Igbo. Kedụ maka akụkọ gbasara etu e si aghọta ihe ọja na-ekwu, ka ọ bụ akụkọ gbasara isi dada, ebee a ka anyị ga-ebido? BBC Igbo nọ ya mgbe Obi Ọnịcha nakwa Igwe Nnewi gbara ọfala, anyị gara Ikeji ndị Arọndịzuogụ, Imo Ọka ndị Ọka, ịta ụkazị ndị Emii, nakwa ịwa akwa ndị Ihitte Uboma. Ndị a ma ama bịara be anyị Isaac na Nneka Moses bịara be anyị n'oge emume Valentine Ọtụtụ ndị a ma ama bịara kpọtụrụ anyị n'ụlọọrụ anyị. Ma Uche Jumbo, Victoria Anunobi, Okey Ogunjiofor, Teco Benson, Isaac na Nneka Moses, Chizzy Alichi, Onny Michael, nakwa Anita Joseph. Ndị ọzọ Victor Osuagwu, Frodd nke Big Brother, Ugoezu j. Ugoezu, Uche Ogbodo, Daniel K Daniel, Destiny Etiko, Chidi Diribe (Titus), na Ruff Coin Nwa Aba. Mkparịtaụka ndị a dị n'ọgbakọ anyị na Facebook. Maka Ahụike: Anyị mere nnyocha, nchọpụta ma kọwaakwa ọtụtụ ihe gbasara ahụike n'ụzọ dị iche iche. Anyị kọwara ihe nwaanyị kwesịrị ịma maka ọtụ ya, ihe nwoke kwesịrị ịma maka amụ ya, ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị, Ihe na-enye ụmụnwoke afọ beer nakwa ndị ọzọ. Ndị mmadụ na-ebuso m iro maka a chọrọ m ka akwụsị ibi nwaanyị ugwu Anyị akọwakwuola etu ị ga-esi chebiri ma gbochie ịba Lassa nakwa ọrịa Coronavirus Covid-19 nakwa nri onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-eri. Dịka afọ ọhụrụ a na-amalitere anyị, nkwa anyị na-ekwe gị bụ na nke dị n'ihu ga-aka nke ị hụrụ anya ugbua. Gwazịkwa ndị enyi gị maka anyị. Akụkọ ndị ọzọ ga amazị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'" afirika-52659255,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52659255,Coronavirus lockdown: Etu e si achụghachị ọtụtụ ndị na-achọ ịbata n'Abia na Enugwu Steeti,Kamgbe ọnwa abụọ gara ka ọtụtụ steeti na Naịjirịa bidoro mmachi i si na steeti bata na steeti n'ihi coronavirus.,"N'otu aka ahụ Onyeisiala Buhari nyekwara iwu ka agbachie okeala jikọtara steeti niile, mana na ọtụtụ mmadụ ka na-esi n'otu steeti baa n'ọzọ. Ọtụtụ mgbe ka a nụ akụkọ na ndị nchekwa nwuchiri ndị si mpaghara ugwu na-chọ ịbata na steeti dị n'ọwụwanyanwụ. Mana i ji chọpụta nke bụ eziokwu, anyị kpọtụrụ ndị gọọmentị ụfọdụ steeti dị n'ọwụwanyanwụ. N'Abia Steeti odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka, ọ sị na nke a bụ eziokwu. O kwuru na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa nwuchiri ụgbọala bu ndị mmadụ na-achọ ịbata Abia Steeti. N'ịmaatụ, ọ sị na e jidere ụmụnwaanyị si Akwa Ibom nabata Aba, jidekwa ndị awụsa si ụzọ Enugwu nabata Aba na nso nso. Ọ sị na nso nso na e jidekwara ụgbọala ukwu bu ndị ugwu si Akwa Ibom nabata Umuahia mana a chụghachịrị ndị niile ahụ azụ ebe ha si. N'otu aka ahụ, kọmishịọna mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Aroh sị na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa na-anwụchi ndị na-abata na steeti ha. Ọ sị na na-esi na steeti dị iche iche gụnyere Legọs, Abuja, nakwa mpaghara ugwu ndị ọzọ. Mana ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ka ọ dị n'aka ịma kpọmkwem ebe ndị a si na-achọ ịbata Enugwu. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ha na-achụghachị ndị ekwesịghị ịbata n'obodo ruru okeala nso. Na kọmshịona uweojii bụ Ahmed Abdulrahman na-agarukwa ebe ahụ ịhụ etu ndị otu ya si echekwa okeala ndị ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43835095,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43835095,Peter Obi: Ụnụ akpazịla agwa dịka Emperọ Nero nke Rome,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a: Peter Obi agwala ndị ndu Naịjirịa ka ha kwụsị ịkpa agwa ka Emperor Nero nke mba Rome,"Onye bụ bu Gọvanọ Anambra Steeti bụ Peter Obi agwala ụmụ Naịjirịa karịsa ndị ndu ka ha kwụsị ịkpa agwa dịka Emperor Nero bụ onyeisi mba Rome nọ na-akpọ ụbọ egwu ebe Rome na-agba ọkụ. O kwuru na ndị Naịjirịa ji ụgwọ ruru ijeri dọlla iri asaa n'ime afọ iri akachapụrụ ụgwọ ndị ha ji. Ọkaiwu Femi Falana kwuru na ndị omeiwu nwere ikike pụrụiche Onye ọkaiwu ugwu ruru onye bụ Femi Falana ekwuola na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa nwere ikike izukọ ma ọfọ ọchịchị ọ dị ya ma ọ bụ ọdịghị ya. O kwuru na-edere nke a n'akwụkwọ iwu Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: N'akụkọ mba ofesi Ogbunigwe mgbagbu onwe agbara na kabul, bụ isi obodo Afghan ma gbuo mmadụ iri ise na asaa, ebe ọtụtụ merụrụ ahụ. Nke a mere dịka ndị mmadụ na-edeba ha aha maka ntuliaka, ebe ndị IS kwuru na-aka ha dị na ya. N'egwuregwu Chelsea jiri ọkpụ abụọ chara acha a na-asataghị otu merie ndị Southampton iji tozuo oke n'agba nke ịkpeazụ asọmpi iko FA. Ebe ha ga-ezute Manchester United n'ime abalị iri na itoolu nke ọnwa Mee. Nkeji abalịa: Gere akụkọ nke abalịa n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa: 'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny" afirika-44165619,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44165619,Nafdac laghachinụ n'ọdọ ụgbọ mmiri - Osinbajo,Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgwụ na nri akpọrọ Nafdac ekwuola na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo enyela iwu ka ha laghachi na ọdọ ụgbọmmiri ọzigbo.,"Akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye Iwu a biara ka o tebeghi aka onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye boro ọṅuṅu ọgwụ ike dị n'etiti ndị ntoroọbia na ntụbata ụfọdụ ihe ndị amachiri n'iwu. Nafdac kwuru na mkpebi a ga-enyeaka ibelata ntụbata ogwuike na ihe ndị ọzọ na-adịghị ahụ mma na Naịjirịa. N'ọnụ ha,""Nafdac natara akwụkwọ osote onyeisiala weputara na Mee 16."" Adeyeye kwuru na n'oge adịghị anya ọtụtụ ndị Naịjirịa anwụọla maka ọgwụ ike na nri na adịghị ahụ mma. Ọ kwuru na ọgwụike dịka Codeine,Tramadol, na pentazocine egbuola ọtụtụ ndị mmadụ. Ọgwuike egbuola ọtụtụ ndi ntoroọbia na Naịjirịa n'oge na-adịghị anya N'ọnụ ya,ọnwụ ndị a mere maka e wepụrụ Nafdac na ọdọ ụgbọ mmiri kemgbe 2011. Adeleke kwuru na ọ bụkwa maka ihe nyocha ndị BBC mere nke gosipụtara nnukwu ọhọm dị n'ọgwụ akpọrọ Codeine wetara uche Nafdac n'ịlaghachị n'ọdọ ụgbọ mmiri. O kwuru na Nafdac ga-akwụsị mbụbata ọgwụike n'ọdọ ụgbọ mmiri. Akụkọ ndị ga-amasi gị:" afirika-49751630,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49751630,"Gabon Camp: 'Anyị enweghị ọkụ, okporo ụzọ, ụlọọgwụ maọbụ ụlọakwụkwọ kamgbe afọ 1970","Otu obodo nọ n'Emene Enugwu steeti a kpọrọ ""Gabon Community"" akwaala arịrị na gọọmentị Enugwu agbahapụla ha n'ihe banyere akụrụngwa eji ebi ndụ.","Ụmụaka na Ụmụnwaanyị Gabon Camp Enugwu ebe ha na-asa akwa na mmiri Ekulu Ha sị na ha enweghi mmiri ọṅụṅụ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ, ezi okporo ụzọ, ezi ụlọ obibi kama na ha niile bụ ụlọ aja. Eze na-achịkọta obodo a bụ Igwe John Nomeh gwara BBC na ha si n'Ezza dị n'Ebonyi Steeti bịa biri n'ime ọhịa dị n'azụ ọdụọgbọelu Akanu Ibiam, Enugwu. O Kwuru na ọ bụ kamgbe afọ 1970 alụchara agha Biafra ka nna ya na ndị ọzọ ya na-akọ ụgbo bịara n'obodo a ịchọ ihe afọ ga-eri ma biri zie ebe a. Ọ sị na ụlọ dị n'obodo a ugbua ruru otu narị na iri ise, ebe ọnụọgụgụ ndị obodo karịrị otu puku, gụnyere ụmụnwaanyị na ụmụaka. Mmiri Ekulu Enugwu, ebe a ka ndị Gabon camp na ekute mmiri Igwe Nomeh sị na ihe mere eji a kpọ ha 'Gabon Community' bụ afọ ndị gara aga na ụfọdụ ụmụaka a mụrụ n'obodo gara Panya dị na mba Gabon ịkpata ego. Mana ha mechara gbara aka lọta nke mere onye ọbụla ji kwekọrịta ịkpọ ebe ahụ 'Gabon Community'. Igwe Nomeh na ndu obodo bụ John Nweke sị na ihe mere ha enweghi ụlọ Simentị bụ na ndị obodo Nike gwara ha ka ha ghara ịrụ ụlọ simentị maka na ha azụghị ala azụ. Ihe dịka ọgụ afọ gara aga ka ndị agha ụgbọelu Naịjirịa zụrụ ala ma gwa ha ka ha arụla ụlọ simentị na ya. Ụfọdụ ebe obibi n'obodo a Onyeisi ndị nche bụ Chinedi Nwaofia rịọrọ gọọmenti Enugwu ka e nye ha ọkụ, mmiri na ụlọọgwu iji chekwaa ndụ ha. O kwuru na kwa mgbe kwa mgbe ka ụmnwaanyị ha na-anwụ ebe ha na-amụ nwa n'ihi enweghi ụlọọgwụ n'obodo a. Ụlọụka Katọlik dị n'obodo Gabon, Enugwu Steeti Ndị obodo sị na ugbua na ọ bụ naanị mmiri Ekulu ka ha sị enweta mmiri ọṅụṅụ. Monica Chima, onye nne ma bụrụkwa onye ọrụ ugbo na Gabon Camp Enugwu Ihe eji mara 'Gabon Community' bụ ịkọpụta nrị dị iche iche dịka ji, akpụ nakwa akwụkwọ nrị ha na-erisi ndị bi n'Enugwu. Ụfọdụ ụlọ aja dị n'obodo 'Gabon Community' Ụfọdụ ndị obodo 'Gabon Community' dịka Nwaofia Chinedu na Monica Chima kwara arịrị sị na gọọmentị na-echeta ha ma oge ntuliaka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ruo. Igwe John Nomeh, aka na-achịkọta Gabon Camp Enugwu Mana ngwa ngwa nke a ga-achara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a na-echefu ha na-eleghi anya n'azụ. Ime obdodo 'Gabon Community' Igwe Nomeh kwuru na ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị ọbịa n'Enugwu mana ọ rịọrọ ka gọọmentị biko nye ha ọkụ Latrik, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na mmiri ọṅụṅụ. Ọ gara n'ihu rịọ ka gọọmentị Enugwu Steeti nyere ha aka n'okwu banyere ịnapụ ha ala ma gbatara ha ọsọ enyemaka site n'izi ha ebe ọzọ ha ga azụ ala biri. Akụkọ ga-amasị gị" 42935668,https://www.bbc.com/igbo/42935668,Anwuchiela ihe ruru mmadụ 200 si Mexico aga Amerịka,Ihe ruru mmadụ nari abụọ (200) si ndida Amerịka aga mba Amerịka ka a hụrụ na ime gwongworo eji ebu ibu.,"Ụmụnwaanyi na ụmụaka so na ndị a hụrụ na ime gwongworo ahụ Ụmụ aka, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyi nọ na okpuru gwongworo a enweghị mmiri mọ bụ nri mgbe a chopụtara ha na Tamaulipas Steetị di na ugwu Mexico. Ndị a si Guatemala, Honduras na El Salvador na eje Amerịka. Ndị na ahu maka mpụ gbasara ire mmadụ na Mexico na akọwa na ha nwụchikorọ mmadụ atọ aka ha nọ na okwu a. Uweojii na Mexico si na ha kwusiri gwongworo a na ebe ha na eme nyocha na okporo ụzụ were chọpụta na ọ mmadu ka ezoro na ime ya. Ndị goomenti Mexico na-akọwa na ụmụ aka nne mo bụ nna esoghị nọ na ime gwongworo a. Na onwa gara aga, ihe kariri mmadụ otu nari na iri asaa ejighị akwụkwọ ha ji aga Amerịka ka ejidere na steetị Coahuilia ba Tamaulipas di na Mexico. Ndị si Guatemala, Honduras na El Salvador kachasi na ndị ejighị akwụkwọ a na nwauchiko ka ha na eji Amerịka. Onyeisiala mba Amerịka bu Donald Trump ekwuola na ya ga eji aka ike so ndị na abata Amerịka na ụzọ akwụghi ọtọ, ma na ekwusikwa ike na ya ga arụ mgbidi na ụsọ Amerịka na Mexico." afirika-44277380,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44277380,World Menstrual Hygiene Day: Ụzọ ịse ụmụagbọghọ ga-esi debe onwe ha ọcha na nsọ,'Menstrual Hygiene Day' bụ ụbọchị e wepụtara iche maka ikuziri ụmụagbọghọ etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha mgbe ha nọ na nsọ.,"Akwa nso e ji akwa ndị ochie arụpụta Otu nwaanyị na-arụ n'ụlọọrụ enyemaka ebe a na-akuziri ụmụaka etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha bụ Ijeamaka Nwizu, gwara BBC Igbo ụzọ ise nwaanyị ga-eji debe onwe ya ọcha. 1. 'Mụta kaesi arụ akwa eji anọ nanso' Ọ bụrụ na i nweghị ego imefu n'akwa nsọ a na-etufu etufu a kpọrọ 'disposble pad' na bekee, ọ ga-adịrị gị mma ma ị mụta etu ị ga-esi kwaa nke a na-asụ asụ. 2. Gbaa mbọ gbanwe ya bụ akwa kwa elekere anọ O kwesiri ka nwaanyị ọbụla na-agbanwe akwa nso ya kwa elekere anọ Nke a bụ iji gbochie mmetọ ejiji gị ma gbochikwa isi na ihe unyi ndị ọzọ nwereike ibute ọrịa. 3. Sachaa ahụ gị ọfụma O kwesiri ka ị kwọ aka ọfụma ma ị metụ cha akwa nsọ gị aka Ịsa ahụ gị ka o si kwesi ịdị bụkwa ụzọ ọzọ ị ga-esi gbochie ọrịa ndị si n'ụzọ unyi abịa n'ime ahụ mmadu. 4. Mara etu ị ga-esi tufu akwa nsọ gị ma ị mechaa Ọ gaghị abanyere gị uru ma ọ bụrụ na ijiri akwa nsọ gị mee ka mbara gị ruo inyi Ọ dị mma ibu mbara na gburugburu gị n'ụche ma ị na-achọ ebe ị ga-etufu akwa nsọ gị. Ị tufuo ya n'ụzọ ezighị ezi nwereike ibute ọrịa dị icheiche. 5. Jiri ọzọ ma ị na-apụ apụ Ụmụakwụkwọ ji ụfọdụ akpa akwa nsọ dị n'ime ya Nke a bụ maka ịdị njikere ma gbochikwa ihe mberede ime gị n'ụlọọrụ, n'ụlọakwụkwọ maọbụ ebe ọ bụla ị jere. Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a: Ụbọchị pụrụiche maka nsọ nwaanyị Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44464813,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44464813,"Ọṅụ juru Amerịka, Kanada na Mekziko obi taa - Iko Mbaụwa 2026","Mba Amerịka, Kanada na Mekziko ga-ejikọ aka ọnụ hazie ma kwaa ọbịa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2026.","Ekbebiela ebe a ga-agba Iko Mbaụwa 2026 Nke a pụtara taa na Rọshịa ebe a na-eme asọmpi Iko Mbaụwa 2018. Mba ndị ahụ meriri mba si Afrịka bụ Moroko, iwere ohere ahụ. Mba atọ ndị a jikọrọ aka ji votu 134 merie ndị Moroko bụ ndị nwere votu 65. Ya bụ Iko Mbaụwa nke 2026 ga-abụ ọkacha n'Iko Mbaụwa maka na mba 48 ga-etinye ọkpa na ya bụ otu ịba na mkpụrụ ụbọchị iri atọ na anọ (34). Nke a ga-eweta asọmpị iri asatọ (80) zuru ezu. N'ọṅụ ya onyeisi egwu asọmpị dị n'aka bụ Carlos Cordeiro, sị na obodo atọ a ""bụ otu n'ime egwu bọọlụ"". O kelere ndị mbaụwa maka ugwu a kwanyeere ha site n'inye ha ohere ịkwa ọbịa Iko Mbaụwa a. N'ime mba 211 so na Fifa, 200 mere ntuliaka n'ọgbakọ nke 68 ha nwere na Mekziko taa bụ Wenezde, ebe a chọrọ ihe dịka 104 votu iji nwee meri na ya bụ ntuliaka. Mba Gana esoghị na ya bụ ntuliaka maka mmachi gọọmenti ha machiri ha maka ebubo mpụ eboro ndị ọrụ ha. Ụmụ obere mba so Amerịka dịka Guam, US Vegin Islandị na Puerto Rico esokwaghị mee ya bụ ntụliaka. Cheta na Mekziko (1970 na 1986) na mba US (1994) akwabuola mbaụwa ọbịa Iko Mbaụwa a. Ndị mba atọ bụ US, Kanada na Meziko eritela ịkwa mbaụwa ọbịa" afirika-54012081,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54012081,Deregulation: Ọnụ ego 'fuel' dịzị n'aka ndị na-ere ya,"Ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa arịala ugbua, site na naịra 141 ruo naịra 151, mana ndị mmadụ na-ekwu na ha zụtara ya n'ọnụ naịra 160 n'ụtụtụ Tọzde.","""Gọomentị anaghị ajụ ka anyị enwete ego anyị ga-akwụ n'ego ha tinyere na mmanụ ụgbọala"" Nke a bụ maka atụmatụ ọhụrụ nke gọọmentị etiti wepụtara a na-akpọ 'deregulation'. Oge niile ka gọọmentị Naịjirịa na-ekwu maka 'deregulation', ọkachasị n'ihe gbasara mmepụta mmanụ ụgbọala nke Bekee kpọrọ 'Premium Motor Spirit' (PMS) maọbụ 'petrol'. Mana gịnị ka ya bụ okwu 'deregulation' pụtara? 'Deregulation' pụtara na gọọmentị ga-esepụ aka ha kpam kpam n'ihe niile gbasara ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Nke a pụtara na gọọmentị ga-ahapụrụ ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, nke a kpọrọ 'independent marketers' na Bekee, ka ha were aka ha na-ahazi ego ole ha ga na-ere ngwaahịa ha. Iwepụ 'fuel subsidy'Ọ ga-ebute ihe ịda oke ọnụ - Chizea Ọ pụtakwara na gọọmentị agaghịzi na-etinye ego iji butuo ọnụahịa mmanụ 'petrol', bụ nke a kpọrọ 'subsidy'. Ihe nke a na-egosi bụ na ọ bụrụ na ọnụahịa mmanụ agbidi (crude oil) rịa elu n'ahịa mba ụwa, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbali na Naịjirịa. Mana ọ bụrụ na ọ gbatuo, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbatu. Gịnị kpatara gọọmentị Naịjirịa agaghị ahazinwu ọnụahịa 'petrol'? Onyeisiala Muhammadu Buhari kwere nkwa na ọchịchị ya ga-ebutu ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa Otu ihe kpatara nke a bụ maka na Naịjirịa anaghị emepụta petrol ga-ezuru ndị bi na ya. Ụlọọrụ atọ na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enweghị nke na-arụ ọrụ etu o kwesịrị. Ya kpatara ụlọọrụ gọọmentị bụ 'Nigerian Natioonal Petroleum Corporation' na ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, na-azụ 'petrol' na mba ofesi, ma jiri ụgbọmmiri bubata ya na Naịjirịa. Nke a pụtakwara na ọ bụ ihe ahịa nyere na mba ofesi ga-ekwu ego ole ha ga-ere ya na Naịjirịa. N'oge mbụ, gọọmentị na-eji aka ha tinye ego ole a ga na-ere mmanụ ụgbọala, ma were ego akpa ya kwuzuo ndị na-ere ya ụgwọ nke fọrọnụ. Mana ugbua, ha esepụla aka na ya. Ọ bụ ya mere ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbalie elu. 'Deregulation' ọ bụ ihe ọjọọ? Ụlọọrụ atọ na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enweghị nke na-arụ ọrụ etu o kwesịrị. Ndị ọkacha mara ekwuola na gọọmentị ekwesịghị itinye aka n'ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala. Ha kwuru na nke ahụ ga-eme ka ndị mmadụ bịa tinye ego ha ma hazie ngalaba mmanụ agbidi ka ọ kawanye mma. Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ihe ihere na a naghị enwe ike imepụta 'petrol' na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ọ bụ ebe a ka e si ebupu mmanụ agbidi. 'Deregulation' nwere ike inye aka ka ụdị ihe a kwụsị. Mana ugbua amalitere ya ọhụrụ, ọ ga-afụ ndị mmadụ ụfụ n'ahụ, n'ihi na ọtụtụ ndị dabeere na petrol iji kpata ihe ha na-eri. Kịtaa ọnụego ya rịrị, ọ gaghị atọ ndị mmadụ ọchị chaa chaa." afirika-50246470,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50246470,WWE Crown Jewel: Taa ka Tyson Fury na Braun Strowman ga-achịpụ ya,"Tyson Fury, dimkpa e ji iti ọkpọ mara n'ụwa niile, abanyela n'egwuregwu 'World Wrestling Entertainment'.","Taa bụ ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Ọktoba 2019 ka ya na Braun Strowman ga-ama dimkpa na ibe ya nke ka ike. Strowman n'onwe ya bụkwa agadaga dimkpa okwu ya anaghị ekwe okwukwu. Ọgụ a bụ n'obodo Riyad nke dị na mba Saudi Arabia ka ọ ga-eme na abalị taa. Etu Fury si malite ịgba mgba Tyson Fury na Braun Strowman Ọ bụ otu ụbọchị ebe Tyson Fury nọchapụrụ n'akụkụ na-ekiri mgba ka Strowman bịara chọọ ya okwu. Nke a ekweghi Fury odidi, o wee malie elu chọọ ịga ọgụ, mana ndị mmadụ jituru ya. N'ụbọchị ọzọ, Fury batara n'ogige ebe a na-agba mgba ma kwuo na Strowman ga-arịọ ya mgbaghara maka mkparị ọkparịrị ya. 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu Mana Stowman gwara ya na ọ kụọla aka na gwongworo bu akpa ntu. Ha wee kabie na ha ga-achịpụ ya ka onye ọbụla mara onye karịrị ibe ya. Fury ọ kwụsịla ịkụ ọkpọ? Fury na Otto Wallin kụrụ ọkpọ na ọnwa Sepụtemba Ọ bụ eziokwu na Tyson banyere ịgba mgba nwa mgbe nta, ọ ka na-eti ọkpọ. Ọgụ ikpeazụ ọ lụrụ bụ nke ya na Otoo Wallin n'ọnwa Sepụtemba. A na-ele anya na Fury ga-ezute Deontay Wilder, onye bụ ọkaibe n'ịkụ ọkpọ n'ọnwa Febrụwarị afọ 2020. Onye ọzọ si ịti ọkpọ bata ịgba mgba Mayweather, ọdị mkpụmkpụ eme ire, meriri Big Show na 2008. Na 2008, Floyd Mayweather sikwa iti ọkpọ banye n'ịgba mgba. Mayweather bụ onye ama ama ji iti ọkpọ baa nnukwu ọgaranya. Ọgụ Mayweather na Big Show wuru ewu nke ukwu n'oge ahụ. Na ya bụ ọgụ, Mayweather ji ọkpọ kụpụ Big Show mkpụrụ ọkwụrụ n'anya. Nke a bụ n'agbanyeghị na Big Show bụ gbara nnukwu dịmkpa karịe ebe a tụkọtara ụdị Mayweather atọ. Mana Igbo na-atụ ilu sị na ejighi ibu oke ibu anyụ nsị ukwu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Fisayo Soyombo: Ihe mere o ji zoo ezoo mee nnyocha n'ụlọmkpọrọ" afirika-53783717,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53783717,Imo Tanker Explosion: Etu ọkụ 'tanker' si mebie ihe ma gbagbuo otu nwaanyị n'Owere,"Otu nwaanyị alaala mmụọ oge ihe mberede okporoụzọ mere ka nnukwu ụgbọala bu gaasị gbara ọkụ n'Owere, isi obodo Imo steeti.","Tanka ahụ gbara ọkụ bụ gaasị ka e ji ya ebu Akụkọ kwuru, na ya bụ ihe mere oge ọ fọrọ nkeji olemole ka ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ Fraịde. Ndị nọ ya oge ihe a mere kọrọ na nnukwu ụgbọala ahụ na-achọ ịtụgharị oge ụgbọala ọzọ ji nnukwu ọsọ suo ya wee nwuru ọkụ. Ọkụ a gbapịara nwaanyị ahụ n'ime ụgbọala a, mana onye ọkwọ ụgbọala ji ntakịrị ihe lafere, mana ọkụ ahụ merụrụ ya nnukwu ahụ. Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Imo steeti mechara bịa gbanyụọ ya bụ ọkụ mana tupu ha abịa, nwaanyị ahụ agbapịala. Ndịọrụ mgbanyụ ọkụ bịara gbanyụọ ya bụ ọkụ Onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ na-elekọta Imo na Abia steeti bụ Achi Okidi Ijeoma, gwara BBC na ya bụ ihe mere eme n'Eziokwu. O kwuru na ndịọrụ ya gbara mbọ nke ọma iji menyụọ ọkụ ahụ. Mana Ijeoma gbarụrụ ihu etu ndị bi na mpaghara ebe ihe a mere si kpaso ndịọrụ mgbanyụ ọkụ agwa oge ha bịaruru ịgbanụ ọkụ ahụ. O kwuru na oge ha rutere ebe ahụ, ndị mmadụ malitere ịtụ ha okwute ma mebie ụfọdụ akụrụngwa ha ji arụ ọrụ. ""Ọ bụ site n'enyemaka ndị uweojii ka ndịọrụ anyị ji nwee ike ịgbanyụ ya bụ ọkụ,"" Ijeoma kwuru. Ọ bụ ndị uweojii bịara nyere ndịọrụ mgbanyụ ọkụ aka wee gbanyụọ ọkụ ahụ. Ọ gara n'ihu rịọ ka ndị mmadụ kwụsị ụdị agwa ajọọ a n'ihi na ọ nwere ike ime ka obi jụọ ndịọrụ oyi ịrụ ọrụ ha etu o kwesịrị. Chioke Ibe kelere ndị uweojii Imo steeti maka etu ha si nye aka hụ na a gbanyụrụ ya bụ ọkụ. O kwuru na oge ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ ka buputere ozu otu onye n'ime ụgbọala ahụ gbara ọkụ, ebe atọ ndị ọzọ ka ha hụrụ merụrụ ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Igbo Tradition: Mkpọnala - Egbe ike na-emete mmụọ na mmadụ n'ụra" 48844144,https://www.bbc.com/igbo/48844144,Elisha Abbo : Ndị uweojii amalitela inyocha ụra ọ mara nwaanyị,"Senetọ na-anọchite Adamawa-North bụ Elisha Ishaku Abbo arịọla ụmụ Naijiria, Ụlọomeiwu Ukwu, otu PDP na nwaanyị ọ mara ụra mgbaghara.","N'ozi o wepụtara na Twitter ụbọchị Wenezde, Abbo kwuru ka onye ọbụla gbara ya n'ihi na ""ọ bụrụ mmehie adịghị, mgbaghara agaghị adị."" Ọ gara n'ihu gwa nwaanyị ọ mara ụma sị, ""na agbanyeghị ihe i mere m, ekwesịghị m ime gị ihe m mere gị."" End of Twitter post, 1 Cheta na Elisha Abbo mara nwaanyị ụra n'ọdọahịa ebe a na-ere ihe egwuregwu ndị okenye. Igwe mmadụ pụtara mee ngagharịwe n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n' Abuja ụbọchị Wenezde na-akpo oku ka ndị uweojii nwuchie Abbo maka iti nwaanyị ihe. Ihe ndị uweojii na-eme maka ụra Elisha Abbo mara nwaanyị Onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Abubakar Adamu nyere ntuziaka ka ndị ọrụ ya nwụchie ma nyocha Abbo maka ihe o mere. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii okwu n'ọha bụ Frank Mba na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka-eme ezigbo nyocha banyere ya bụ okwu. Abbo gbaburu isi akwara mbụ na-ekwu na onye ya tiri ihe mejọrọ nwanne ya. Cheta na umụ Naijiria chịrị ọkụ wunyere Elisha Abbo n'ahụ maka ịma nwaanyị aka ntị chara ọkụ n'ọdọahịa ihe egwuregwu ndị okenye dị na Banex Plaza, Abuja. Ihe ahụ mere n'abalị 11 nke ọnwa Maachị mana aha Abbo bidoro wubere na soshal midia ụbọchị Tuzde, abalị abụọ nke ọnwa Julai ka ụlọọrụ ntaakụkọ Premium Times wepụtara ihe onyonyo maka ya. Ihe onyonyo ahụ gosiri Abbo ebe ọ mara nwaanyị ụra ugboro ugboro maka isi ya ""obi gị dere jụụ' dịka ọ na-abara onye na-ere ihe n'ọdọahịa ahụ mba. Akụkọ kwuru na Abbo na ụmụnwaanyị atọ banyere ọdọahịa ihe egwuregwu ndị okenye ịzụ ihe. Mana na egbughị oge, otu n'ime ụmụnwaanyị ahụ bidoro gbọwa agbọ. Nke mere ka onye na-ere ahịa gwa ya na o kwesiri ịgbọ agbọ ahụ na mbara, na ọ bụghị n'ọdọahịa ya ebe ọ bụghị nwata. Okwu ahụ mere Abbo bido bowe ndị nwe ọdọahịa ebubo na o nwere ihe ha tinyere na ntụoyi ha nke mere ka onye ya na ya so rịawa ahụ. Onye nwe ahịa sara ya sị na ọ bụrụ otu ahụ, onye ọbụla nọ ebe ahụ kara agabiga otu ihe ahụ. Okwu ahụ bulitere ndọrịtaụka n'etiti ha abụọ, nke mere ka enyi onye ọdọahịa rịọwara ya ka o dere jụụ, o were saa ya ụra dị ọkụ. Ndị uweojii bụ ndị Abbo kpọrọ ekwenti nọrọ ebe ahụ dịka ka ọ na-akụ nwaanyị ahụ ihe tinka kụrụ pan mana ha egboghị ọgụ. Oge BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwe ntị ịnụrụ olu ya, Abbo kwetara na ya bụ ihe mere. O kwuru na ya mere nke ahụ iji bọtara nwanne ya nwaanyị, onye e tiri ihe ọbọ. ""Ihe a bụ ihe mere tupu m banye n'ọchịchị. Ọ bụ ndị iro ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpara m nkata ọjọọ palitere ya bụ okwu."" Gee ihe o kwuburu n'uju ebe a: Elisha Abbo: Etiri m ya ihe iji bọọ ihe o tiri nwanne m nwaanyị Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu: Ọtụtụ ụmụ Naijiria akatọọla Senetọ Abbo maka ibi nwaanyị aka. Amnesty International kpọrọ oku ka ndị uweojii lebanye okwu ahụ anya. Abike Dabiri, onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ndị nọ na mba ndị ọzọ kpọrọ oku ka a kpụpụ ya ụlọikpe. Onye ojeozi Goodluck Jonathan bụ Reno Omokri kpọkuru PDP ha ha kaatọ agwa Abbo, na o kwesịghị ịbụ onye omeiwu Naijiria. Femi Fani Kayode, obnye nwere agba na PDP kpọọ oku ka ndị uweojii nwuchia ya. Otiegwu a ma ama bụ Banky W kwuru na ọ dị mkpa ilezi anya na ụdị ndị a na-ahọpụta ịbanye ụlọomeiwu. Onye ihe nkiri a ma ama bụ Kate Henshaw sị ihere megbuo Senetọ ahụ maka iti mmadụ ihe. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43827668,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43827668,Ihe mere ndị Naịjịria ji enye otu ụzọ n'ụzọ iri,Ọtụtụ ndị Naịjiria so n'otu kraist kwetere na ọ bụ iwu inye otu ụzọ n'ụzọ iri n'ụlọ ụka.,"Ụlọụka Adeboye akpọrọ Redemption bụ otu ebe kachasi eto na Naịjirịa Mana Yemisi Adegoke dere na ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ onyinye otu ụzọ n'ụzọ iri pụtara na ndị ogbenye na-akwụ ụgwọ ndụ mmefusi ego ndị ọgaranya na-ebi na Naịjịria dịka ndị ụkọchukwu. ""Onye ọbụla na anaghị akwụ otu ụzọ n'ụzọ iri agaghị aga eligwe, kpomkwem."" Ụkọchukwu Enoch Adeboye gwara ndị ụkọchukwu na Legọs na mbido ọnwa. ""Laghachị nụ, ma emecha nzụkọ a ka ụnụ kwụpụta ma dozie ụzọ unu na ndị unu na-edu."" O tiri nke a n'iwu nye ha na Ridemshon Kampụ. Ị bụgharị efere onyinye bụ ihe gbagoro ahọ na nzụkọ Kraist ,mana okwesiri ị bụ iwu? Ụkọchukwu Adeboye ekwubuola maka ya bụ onyinye ọtụtụ mgbe.""Ị kwụ otu ụzọ n'ụzọ iri abụghị ihe a na-elechapụrụ anya."" Ọyọkwara ka ha gaa lee akwụkwọ ozi Malachị nke atọ site n'amaokwu nke asato ruo iri na otu. N'agba ọhụrụ ntụgharị akwụkwọ nsọ ebe ahụ dị n'akwụkwọ nsọ kwuru na: ""Abum Chukwu onye kachasị ike, a na m a gwa gi ka i nwaa m. Weta otu ụzọ n'ụzọ iri n'ụlọ ndokwa m, ka nri wee juputa n'ụlọ nsọ m. Mgbe ahụ ka m ga -emepe ụzọ eligwe wedata ngọzị zuru oke.'' Ntụgharị ndị ọzọ kpọrọ ya tait nke pụtara otu ụzọ n'ụzọ iri. Ndị Naịjirịa na-adọgha isiokwu a na soshal midia. Ụfọdụ ndị nkatọ na-ekwu na ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-eti iwu ka ndị otu ha na-enye otu ụzọ n'ụzọ iri kpatara nnukwu akụ na ụba. Ebe e nwere ọkara nde 180 ndị Naijiria kwenyere na kraist, o gosiri na akụ na ụba ụlọ ụka ga-akarịakarị. Ụkọchukwu Adeboye n'onwe ya ka edebara aha ya n'akwụkwọ Forbes dika ụkọchukwu kacha nwe ego na mba ụwa niile n'ogoogo nde dọla 130. 'Nkụzị aghụghọ' Otu onye a ma ama dịka onye na-akatọ otu ụzọ n'ụzọ iri ma bụrụkwa onye na-eme mgbasaozi n'igwe redio akpọrọ 'Daddy Freeze' kwuru na ihe na-ewe ya iwe bụ na ndị ụkọchukwu na-agwa ndị ha na-edu bụ ndị ogbenye na ha na-enye ụlọ ụka ego, Chukwu ga-eme ha ọgaranya. N'ọnụ ya, ""ndi ọdịka ha na-abawanye na akụ na ụba bụ ndị ụkọchukwu na-agbasa ozioma akụ na ụba.'' Ifedayo Olarinde,nke a kpọrọ""Daddy Freeze''so na ndị na-ekwugide isiokwu taiti ""Kedu ka ị ga-esi nwee ụkọchukwu ga-esite na ego onyinye na otu ụzọ n'ụzọ iri ndị ha na-edu were rụcha ụlọakwụkwọ ma ọ garara ndị ndu ha ọnụ ịkpọta ụmụ ha. Aha onye mgbasa ozi bụ Ifedayo Olarinde na-akwu otu ụzọ n'ụzọ iri ma kwenye n'ụzọ kraist mana o kwetere na otu ụzọ n'ụzọ iri bụ ihe agba ochie na adịghịzị mkpa. ""Ọ bụ nkụzi aghụghọ nke na-etinye ndị mmadụ n'agbụ.'' Ihe nkwụpụta a buterela Daddy Freeze Ndị ụkọchukwu akatọọla ihe o na-ekwu nakwa ndị ụfọdụ mmadụ na-agbara ya ọsọ. ""Onweghị onye chọrọ ka m rụọrọ ya ọrụ', o kwuru. Mana e kwetere m na ihe m na-eme, a na m emere ya ndị mmadụ ka ha si n'agbụ pụọ. Ọ bụ naani onye otu Kraist na-adogha ihe gbasara isiokwu a. Ụfọdụ ndị ụkọchukwu a ma ama ekwuola na ọbụghị iwu. Irụ ọrụ Chukwu Idris Bello-Osagie, ụkọchukwu na church di na Legọs kwuru na isiokwu a dịmkpa na-ebe ndị otu Kraist nọ mana o kwukwara na ekwesighị ị ma ya ka iwu. O kwukwara na ọhiara ahụ ị hụ onye na-eso ụzọ Kraist ghara i na-enye onyinye. ""Otu ụzọ n'ụzọ iri abụghị maka one ina-enye,obụghị iwu, kama o kwesiri ị bụ omume''.-Ukọchụkwụ Bello Osagie ""N'obodo dika Naijirịa na-enweghi ọtụtụ ihe e ji atụ ndụ mmanụ, ọ bụ ụlọ ụka na-eweputa ego ha were ya gboro ndị na-enweghị ike nyere onwe ha aka. Ọ sị kwa na-eji ego agbasa ozioma nke Kraist. Ndị oje ụka m zutere na Legọs kwuru na obi dị ha mma ịdị na-akwụ otu ụzọ n'ụzọ iri. Ụfọdụ sị na ha ga na-eme ya maka na ọ na-abara ha uru. Ebe ufọdụ dika Temitope Olagbegi kwuru na ndụ imefusi ego ndị ụkọchukwu diri Chukwu. N'agbanyeghị ndụ imefusi ego ndị ụkọchukwu akwụsịghị ndị otu Kraist inye onyinye a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-44200152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44200152,Ndị na-ere mmadụ atọọrọla ụmụakwụkwọ na Benin,"Ndị na-atụ mgbere mmadụ atọrọla ihe ruru ụmụakwụkwọ 100 n'otu ụlọakwụkwọ dị na Benin, Edo Steeti n'ime ọnwa anọ.","Ihe ruru mmadụ iri 150 bụ ndị si mba Libya lọta n'ọdọ ụgbọelu dị na Legọs n'abalị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2017. Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Godwin Obaseki n'okwu ịtụ mgbere mmadụ bụ Solomon Okoduwa kwuru na ọ bụ ndị nkuzi ha gwara ya nke a. O kwuru na ndị ọtụ mgbere adịla n'ebe ụmụakwụkwọ nọ. Okoduwa kwuru nke a ụnyaahụ na Benin n'emume akpọrọ one advocacy dịka ọṅụrụ iyi na gọọmentị agaghị ekwe ka nke a gaa n'ihu. O kwuru na gọọment ehiwela ndị ọrụ ọtawike na-ahụ maka ịtụmgbere mmadụ na Steeti ahụ. Ụmụ Naịjirịa si mba Libya lọta Okoduwa dọrọ ụmụakwụkwọ a akanantị, ka ha saa anya mmiri maka mmadụ ọbụla ịghọgbu ha n'imee njem gaa Libya ""Site ugbu a gawa n'ihu mee mkpesa maka onye ọbụla ga-asị mee njem na Yurope, atụmatụ aha bụ ịkpọfe gị ịkpa Sahara na osimmiri mediterranean."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47028763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47028763,Nnamdi Kanu: Anyị enwebeghi okwu maka njem Nnamdi Kanu - Lai Mohammed,Foto dị iche iche na-apụta na soshal midia na-arụtụ aka na Nnamdi Kanu ahapụla mba Izrel gawa mba ya nke abụọ bụ Briten.,"Kepukepu mbụ kwuru na Maazị Kanu nọ na Briten pụtara na Facebook ubọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị. Ka ndị mmadụ ka na-ajụ ma akụkọ a ọ bụ eziokwu, akara Twitter bu aha Maazi Kanu dere na ọ nọzị mba Briten, ma wepụtakwa otu n'ime foto abụọ na-agagharị na soshal midia. Nke a ga-abụ mbụ Kanu na-alaghachị mba Briten kemgbe ndị agha Naịjirịa wakporo be ya n'afọ 2017 n'ime emume ha kpọrọ ""Egwu Eke"". N'ime mgbagwoju anya ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ so ahụghị ya n'anya, Maazị Kanu pụtara ihe na mba Izrel n'ọnwa Oktoba nke afọ 2018. BBC Igbo jụrụ Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Lai Mohammed, ihe gọọmentị Naịjirịa nwere ikwu maka njem Kanu, mana o kwuru na ya amaghị maka njem ahụ. Ọ si, ""Ejighi m ihe dị na soshal midia arụ ọrụ. Ọ bụrụ na onwere ihe mere dị mkpa anyị kwesịrị itinye ọnụ na ya, anyị ga-etinye ọnụ. Ka o si la dị, onweghi ihe m nwereike ikwu maka okwu a ugbua."" Lai Mohammed kwukwara ka BBC kpọghachị ya ma e mecha makana ọ nọ n'ime nzukọ. Nnamdi Kanu ka bụ onyeisi IPOB- Emmanuel Kanu BBC gbakwara mbo ịnụta n'ọnụ otu n'ime ndị Ipob na London mana onweghi onye zara ekwentị ya. Ka o si la dị, Nnamdi Kanu bụ nwaafọ Briten, nke mere na o nwere ohere ịga mba ahụ mgbe ọ chọrọ. Okwu ebubo mmegide obodo bụ nke Naịjirịa na-ebo ya, na mba Briten, Kanu abụghị onye a na-ahụ ka onye megidere iwu ọbụla. N'otu aka ahụ, Ipob abụghị otu iwu machiri na Briten, dịka ọ bụ na Naịjirịa ugbua." afirika-43468986,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43468986,Achụma ọrụ Globacom: Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe,Ndi otu ụmụnwaanyị akpọrọ Coalition of Women for Justice mere ngagharị iwe n'Enugwu iji gosi na obi adịghị ha mma maka ọchụchụ n'ọrụ ndị Globacom chụrụ ụmụnwaanyị ndị lụrụ di na ndị mụrụ nwa.,"Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe maka Globacom chụrụ ụmụnwaanyị n'ọrụ Ụmụnwaanyị ahụ niile yi uwe ojii ha ji akwa akwa arịrị wee gụrụ egwu na-agagharị ụzọ niile dị n'Enugwu. Onye kpokobara ya bụ ngagharị iwe bụ Onyekaokey Udegbunam, kwuru na nnukwu iwe dị ha n'obi ka ndị nwe ụlọọrụ globacom siri chụọ ụmụnwaanyị niile ndị lụrụ di nakwa ndị mụrụ nwa n'ubọchị Maachị 9. Ha tiri mkpu na ụfọdụ ụmụnwaanyị a achụrụ n'ọrụ anọruola afọ iri na abụọ nakwa iri na ise dgz, bụ ndị achụrụ n'ọrụ, nye ha naanị ụgwọ otu ọnwa wee sị ha lawa. Onyekaokey Udegbunam, onye chikọbara ụmụnwaanyị otu COW4J Ụmụnwaanyị ndị gbakọtara ọnụ ime ngagharị iwe a bụ ndị otu Igboezue, Wacol, Nawoj, na ndị ọzọ kwuru na ha ga na-eme ngagharị iwe ruo oge ndị Globacom ga-enyeghachị ụmụnwaanyị ahụ ọrụ ha maọbụ kwụọ ha nrubere ha niile ozugbo ozugbo. Mana mgbe BBC Igbo kpokuru ndị Globacom, ha sị na ha ekwuputala ebumnuche ha n'igwe Twitter ha ebe ha sị: Onyeisi ụmụnwaanyị igboezue bụ Amaka Okonkwo, yọrọ ndị gọọmentị ka ha taa ụlọọrụ Globacom ahụhụ maka inupu isi n'iwu guzobere ọrụ na Naijirịa. Ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru okwu gụnyere Egodi Igwe nọchitere anya Wacol, Ifeoma Amuta nke Nawoj, Chibota Edozie nke Nawoj na Chieso Animwagwa nke NUJ gwara ndị NCC na NLC ka ha leba anya n'usoro ọjọọ a ndị Globacom jiri kwusi ndị ọrụ ha. Achụrụ ụmụnwaanyị n'ọrụ Globacom na Maachị 9 Ụmụnwaanyị a na-eme ngagharị iwe ji akwụkwọ edepụtachara echiche obi ha wee site n'Ọkpara square dị n'Enugwu gaa obi gọvanọ Enugwu. Ha gụrụkwara egwu gaa ahịa Ogbete dị n'Enugwu tupu ha agaruo n'ụlọọrụ ndị Globacom wee ziruo ozi ha ụlọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye osote gọvanọ Enugwu bụ Cecilia Ezeilo, zutere ụmụnwaanyị ahụ, tie ha aka n'obi ma kwekwaa nkwa na ya ga-agwa Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ihe ha jiri bịa. Mmadụ atọ so n'ụmụnwaanyị ndị Globacom chụrụ n'ọrụ sonyere na ngagharị iwe a n'Enugwu. Osote Gọvanọ Enugwu Cecilia Ezeilo, na-akasi ụmụnwaanyị a obi Ha gwara BBC Igbo na anyammiri juru ha obi ka Globacom si tufuo ha n'agbanyeghị ọtụtụ afọ ha rụrụ ọrụ ha ọfụma. Ha sịrị na ọ dị mwute na ọ bụ ka otu ụbọchị gachara ka emechara ncheta ụmụnwaanyị ka achụrụ ụmụnwaanyị n'ọrụ." egwuregwu-43512556,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43512556,Ibrahimovic eferela Man U aka,Nwafọ mba Sweden na-agbara Manchester United bọọlụ bụ Zlatan Ibrahimovic azọpụla njem iji gaa n'ihu n'akụm bọọlụ ya dịka ọ banyere otu LA Galaxy nke Amerịka.,"Ibrahimovic nwere ọkpụ goolu iri abụọ na itoolu n'ime egwurwegwu iri ise na atọ n'oge ya na Manchester United Manchester United kwupụtara nke a ụbọchị Toosde, ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị na ha nwere nkwekọrịta ka Ibrahimovic chabie ohere ọrụ ya n'atụfughị oge. Ọ bụ ihe iju anya na nwaamadị a emepụtaghị oke ihe kamgbe o si ezumike mmerụ ahụ lọta n'ọnwa Nọvemba. Ihe Ibrahimovic dere n'Instagram ya mgbe Manchester United kwuputara ọpụpụ ya. Ibrahimovic nwere ọkpụ goolu iri abụọ na itoolu n'ime egwuregwu iri ise na atọ n'oge ya na Manchester United. ""Ugbua bụ oge ị ga n'ihu mgbe afọ abụọ mara mma gacharala,"" bụ ihe o dere n'Instagram ya. ""Oke ihe sokwa abịa na ngwụcha. Ekele dịrị otu egwuregwu anyị, ndị egwuregwu anyị na-amasị, ndị otu m, onye nchịkọta anyị na mmadụ niile so keta oke n'oge m niile."" Otu egwuregwu ndị Ibrahimovic gbarala bọọlụ:" 51159925,https://www.bbc.com/igbo/51159925,Imo Protest: 'Ndi PDP goro ndị mere ngagharị iwe n'Owere ego' - APC Imo Steeti,Otu APC n'Imo Steeti ekwuola na ọbụ ogugo ka ndị PDP goro ndị mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka.,"Ụmụnwaanyị na-ebe akwa oge ha mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka Marcelinus Nlemigbo, onyeisi ndị APC na steeti ahụ kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo. Nlemigbo kwuru na ọbụghị ndị Imo mere ngagharị iwe ahụ kama ọ bụ ndị PDP bara n'ime obodo goro. O kwuru sị: ""Mgbe INEC kwuru na ọbụ Ihedioha na ndị PDP meriri ntuliaka, anyị emere ngagharịiwe?"" Content is not available End of Facebook post, 1 ""Anyị ji nwayọ buru okwu anyị gaa ụlọikpe."" ""Ugbua ụlọikpe nyere anyị mmeri, gịnị ka ha na-emere ngagharịiwe."" ""Ọ bụ ụmụaka ha (ndị PDP) kwụrụ ụgwọ n'Owere ebe a ka ha ji mee ngagharịiwe ahụ."" Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Owere oge ya ngagharịiwe na-aga n'ihu. Ọtụtụ ndị gwara ya okwu kwuru na obi adịghị ha mma maka nchụpụ a chụpụrụ Ihedioha. Ngagharịiwe na-abịa dịka Emeka Ihedioha kwuru na ya ewerela ihe etu o si hụ ya. Ihedioha kwuru nke a oge ndị isi otu PDP bịara ịleta ya n'Abuja n'ụbọchị Satọde. O kwuru na ya kwenyesiri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'agbanyeghị ihe a mere. Mana o kwuru hoo haa na ya bụ ikpe ndị 'Supreme Court' egosipụtaghị mbunuche ndị Imo steeti na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'afọ gara aga. Connor McGregor etiwaala 'Slate' Conor McGregor Ọgba mgba a ma ama bụ Connor McGregor emeela ya ọzọ! O jiri naanị ntabi anya iri anọ merie Donald Cerrone na mgba mbụ n'asọmpị UFC kemgbe ọnwa Ọktoba afọ 2018. N'aka ọzọ Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ NNPC n'aha ịchafụ Mele Kyari ekwuola na ihe dị iche adịla n'ọrụ ịbelata ndị na-emebi okoporo mmanụ agbịdị nakwa ndị na-ezu ya n'ohi. O kwuru nke a n'akara Twitter ya dịka ọ gara nleta n'ogige ndị agha mmiri dị n'Ojo Legọs. ""Emir Potsikum ndo - Buhari"" Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala Emir Potiskum bụ Umaru Bubaram ozi itiakanobi maka mwakpo ọ gabigara n'aka ndị omekome bu egbe n'okporoụzọ Kaduna na Zaria. Ndị uweojiii kwuru na mmadụ anọ na-arụrụ Emir ahụ ọrụ nwụrụ na mwakpo ahụ. N'Anambra Idemmiri mebisirị ihe ndi mmadu Gọọmentị Anambra steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka ịwụnye atịtị n'ime ọwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ Ha gwara ndị mmadụ kee nkwụcha maka udu mmiri na'abịa ma kwuo na ọ bụrụ na ndị mmadụ gee ntị ọ ga-enyere gọọmentị aka ịchekwa ndụ na ebe obibi ha. Na mba ofesi, Dịka usoro nchụpụ onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-aga n'ihu, ndị otu ọkaiwu ya ekwuola na usoro ahụ bụ ịwakpo ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụ n'izuụka na-abịa ka a ga-ebido ikpe ya n'ezie. N'egwuregwu, Anthony Joshua bụ odogwu n'iti ọkpọ agaala ịleta onyeisiala Naịjirịa dịka ọ nọ na mba Briten. Joshua kwekwara ya nkwa ị nọchịte anya Naịjirịa ọfụma ma chekwaa aha ya mgbe niile. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Biafra at 50"": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ""" 45443970,https://www.bbc.com/igbo/45443970,Ndị uweojii Anambra: A gbagbughị ụkọchukwu n'Anambra,"Ụkọchukwu David Chidiebere nke ụka a kpọrọ 'Grace and Power Prophetic Ministry', ọ bụ anụ a na-agba egbe ọ na-ata nri?","Akụkọ na-efegharị kwuru na ndị ji egbe ji mgbọ wụgbuo ya n'ụlọụka ya dị n'Ọka, Anambara. Mana ndị uweojii Anambra steeti kwuru na akụkọ ahụ abụghị ezie. Ha kwuru na Chidiebere gbalahụrụ ndị ji egbe wakpoo ya ma wụọ mgbọ n'ụgbọala ya n'okporoụzọ si Enugwu gawa Udi n'Enugwu steeti. Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed nwere, o kwuru na a gbagbughị Pastọ Chidiebere, kama na e ji egbe gbakacha ụgbọala ya, ebe ụkọchụkwụ ahụ gbalagara na-emerụghị ahụ ọbụla. O kwukwara na ọ bụghị n'Anambara steeti ka ndị omekeome ahụ wakporo ụkọchụkwụ ahụ, kama na ọ bụ n'okporoụzọ Udi dị n'Enugwu. ""Ọ bụghị eziokwu. Ihe mere bụ na n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Septemba nke 2018, ebe Elekere Itoolu nke ụtụtụ, ndị ji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo Onyeamụma David Chidiebere n'okporoụzọ sị Enugwu gawa Udi n'Enugwu steeti, wụọ ụgbọala ya mgbọ mana ụkọchukwụ ahụ gbalahapụrụ na-emerụghị ahụ ọbụla. ""Iji mee ka o doo ewu na ọkụkọ anya, onyeisi uweojii ogige B' Division Awka bụ CSP Odion Ekeinde, gara leta ụkọchụkwu ahụ n'ụlọụka ya bụ 'Grace and Power Prophetic Ministry' dị na State Secretariat Road, Aroma, Ọka, ebe ya na ya sere foto."" Mohammed gara n'ihu dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha hapụ ige ntị na kepukepu ahụ na-efegharịnụ. O nweghị onye ma ma ndị omekeome ahụ abụ ndị ojiegbeezu ma ha abụ ndị e zigara ka ha gbagbuo ya bụ ụkọchukwu na-ewu ewu n'Ọka maka ekpere ọ na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42817935,https://www.bbc.com/igbo/42817935,Gọọmenti akwadola ka ndị ọrụ nchekwa tinye anya ịkwusi okwu asi na igwe okwu ọhụrụ,"E nyere iwu a na nzukọ nchekwa nke onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nọ n'isi ya nke e mere n'ụlọ gọọment n'Abuja ụbọchị ịrịabụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị, 2018.","Oge mbụ ndị omeiwu tụrụ alo ọtụtụ inyocha social media ndị mmadụ megidere atụmatụ ịkwusi okwu asi na Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan Ali onye nke gwara ndị ntaakụkọ nke a ka emechara nzukọ ahụ kwuru na okwu asị na-abawanye n'ala Naijiria. Ali sịrị: ""Ndị ọrụ nchekwa obodo kwesịrị ileba anya na mgbasa ọkwu asi na social media ọkachasị nke ndị Naijiria nwere agba."" Ndị bara nzukọ ahụ gụnyere; onye isi nchekwa (Chief of Defence Staff) bụ Generalụ Gabriel Olonisakin, onyeisi ndị agha (Chief of Army Staff) Lt. Gen Tukur Buratai, na onye isi ndị agha ụgbọ-elụ (Chief of Air Staff), Air Marshall Sadique Abubakar. Ndi ọzọ bụ onye-isi ndị agha ụgbọmmịrị ( Chief of Naval Staff) Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas, na onye isi ndị uwe ojii, (Inspector-General of Police), Ibrahim Idris. Ali kwupụtakwara na nzụkọ ahụ lebara anya n'ihe kpatara ọgbaghara dị na etiti ndị na-achị ehi na dnị ọrụugbo nke o boro mmechi e mechiri ọwa ndị na-achị ehi ya na iwu megidere ịchịghari ehi nke ụfọdụ steeti mere ya na ndị nche ime obodo." afirika-46109364,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46109364,"Mid-term elections 2018: Nnamdi Chukwuocha, nwaafọ Igbo so azọ ọchịchị",Nnamdi Chukwuocha so n'aha ga-adị n'akwụkwọ ntuliaka ka ndị Amerịka ga-atụ vootu n'atụmatụ akpọrọ 'mid-term election' na Bekee.,"Chukwuocha bụ onye Amerịka si Naịjirịa na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị Demokrat n'ụlọomeiwu nke obodo Delaware. Chukwuocha dị afọ 47, ga-anọchịte anya ""District 1"". Ọ sị na ọ na-eme ndọrọndọrọ a iji nweta ohere hazie nsogbu dị icheiche ndị ọ na-enwe olileanya ịnọchite anya ha na-agabiga. Nsogbu ndị ahụ gụnyere akụnaụba, mmepe obodo, agụmakwụkwọ, na ihe ndị ọzọ. O meela afọ abụọ ndị Amerịka binyeere Donald Trump aka ka ọ bụrụ onyeisiala ha. Lee ihe ụfọdụ ị kwesịrị ịmata maka ntuliaka Amerịka. Onyeisiala Trump mere ezigbote ngagharị ịchụ nta vootu maka ntuliaka Gịnị bụ ntuliaka'mid-term'? Ntuliaka 'mid-term' bụ ntuliaka ndị Amerịka na-eme kwa afọ anọ ọbụla. Ọ na-adaba n'ime afọ anọ nke onyeisiala Amerịka. Ọ bụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Novemba ka a na-eme ntuliaka a. Kedụ ndị so azọ oche n'afọ a? N'ụlọomeiwu nke nta a kpọrọ ""Congress"", oche niile bụ ihe a na-azọ. Oche ndị a dị 435. Oche dị n'ụlọomeiwu nke ukwu Amerịka a kpọrọ ""Senate"" dị 100, mana ọ bu naanị 35 ka a ga-azọ na ntuliaka a. Steeti 36 ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ga-arụ ọrụ dịka gọvanọ. Ihe a ga-enye ohere ịtụgharị ndị na-achị obodo. Ndị mmadụ ebidola ịtụ vootu Kedụ ndị ga-emeri? Ọ ga-ara ahụ ịmata onye ga-emeri tupu a tụọ vootu maka ihe meburu na mbụ. Makana ntuliaka na-eme n'etiti ọchịchị onyeisiala, ọ ga-abụ ezigbote ohere iji hụ ma onye na-achị ọ na-achịta. Dịka o si eme na mbụ, ntuliaka adịghị amasị onyeisiala na-achị. A na-anapụ pati onye na-achị n'oche 32 na ""Congress"", na abụọ na ""Senate"". Mana afọ a, ndị Demokrat kwesịrị irite oche 23 karịa nke ha nwere ugbua, iji bụrụ ndị ga-achị ya. Na ""Senate"", ha kwesịrị inweta oche abụọ karịa nke ha nwere ugbua. Mana, ọ gaghị adịrị ha mfe makana ha ga-agbalị ịhụ na ndị nkwado ha pụtara tụọ vootu. Ihe a bụ ihe ga-esi ike makana ndị mmadụ adịghị apụta ọfụma na ntuliaka a. Ndị ga-atụ vootu na ntuliaka a A na-eche na ndị ga-apụta mee ntuliaka a bụ ihe dịka pasentị 40 n'ime ndị tozuru ịtụ vootu. Mana nchọpụta na-egosi na ndị mmadụ adịghị ka ha achọrọ iso mee ntuliaka a. Ndị a ga-etinye n'ụloikpe nke ukwu, ihe metụtara ọgwụgwọ nke Bekee kpọrọ ""healthcare"", nakwa akụnaụba obodo, so n'ihe ndị mmadụ ga-eji tụnyere mmadụ. Mana ihe kachasị nwereike ịbụ Donald Trump. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-54187381,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54187381,Nasir El-Rufai: Ịpị amụ na ogbugbu bụ ihe chere onye dinara nwata n'ike na Kaduna,Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steetị etinyela aka n'iwu ga-eme ka a pịa nwoke ọbụla dinara nwaanyị n'ike nakwa wepu akpa nwa nwaanyị dinara nwata nwoke n'ike.,"Iwu ọhụrụ a pụtara na ntaram ahụhụ dịịrị nwoke maọbụ nwaanyị dinara nwata n'ike ga-abụ ịpị nwoke nakwa iwepu akpa nwa nke nwaanyị. A ga-ebipụta aha ndị dị etu a n'akwụkwọ mpụ na nrụrụaka nke mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke ọkaikpe steetị ga-etinyeaka na ya. Site n'itinye aka n'iwu nke Gọvanọ El-Rufai mere n'ụbọchị 11 Sepụtemba, nke a pụtara na ọ bụrụ na iwu na Kaduna Steetị. Iwu a sibu na ọ bụ nga afọ 21 ka onye dinara okenye n'ike ga-aga, ma sịkwa na onye dinara nwata n'ike ga-aga nga ruo oge ọ nwụrụ. Mana, mmegharị iwu ahụ kpebiri na onye dinara onye gafere afọ 14 zute ịpị amụ maọbụ iwepu kpa nwa. Mmegharị ọzọ bụkwa itinye na onye dinara nwata n'ike ga-enwete ikpe ọnwụ. Gọvanọ El-Rufai kelere ndị Omeiwu Kaduna maka iwu ha binyere aka, ma kwuo na iwu tara akpụ ga-enye aka chekwa ụmụaka na steeti ahụ. Ihe ndị nọ n'iwu ọhụrụ a gụnyere:" afirika-45835386,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45835386,Ihe ụmụnwaanyị chere maka utu nwoke,Ọ bụ okwu na-anyị ọtụtụ ụmụnwaanyị arọ n'ọnụ ikwupụta mana ọ dị ha ezi mkpa.,"Ọtụtụ ha na-eji ya eme isi okwu ma ha na ibe ha nọrọ. •Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga •Dọkịnta Bumbum: Aka akparalanụ dibia otele ukwu O meela ka ụfọdụ ụmụada gbahapụ onye chọrọ ịlụ ha, ebe ụfọdụ ndị lụrụ alụ gbaara di ha ụgbọ nwa mkpi. Asọmiri gwụrụ onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ọnụ ka ọ gara ịgba ụmụnwaanyị ajụjụ iji mata ka ọ dị ha mkpa etu ihe nwoke jiri bụrụ nwoke onye ha chọrọ ịlụ ha; ma opere mpe, ka o buru ibu. Ọtụtụ n'ime ha ekweghị aza ajụjụ ahụ. N'ime ndị kara obi, ụfọdụ kwuru na ọ dị ezi mkpa, ebe ụfọdụ sị na ihe a chọrọ na siga bụ anwụrụ. Nwada Amarachi kwuru na ọ dị mkpa iji gbalahụ mgbasa alumdinanwunye. Chinwe Enendu gwara BBC Igbo na ihe dị mkpa bụ nghọta. Nwatanwaanyị ọzọ achọghị ka a kpọ aha kwuru na ọ dị ụmụnwaanyị ezi mkpa maka 'ụmụnwaanyị na-agbara nwoke utu ya bere mpe ọzọ."" Ụfọdụ ụmụnwoke jụrụ ajụ sị na ọ bụghị ka akị ilu si ada ka o si atọ. Emeka Ezekiel kwuru na ""ihe dị mkpa bụ ka utu na-ekeli ekeli"" Ebe onye nkuzi Igbo na Federal College of Education, Kontagora,Niger steeti bụ Chukwudi Ede kwuru na ọ bụ ụmụnwaanyị kwuorola mmiri ukwu na mmiri nta nwere mkpebi nke ka mara ha ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50679553,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50679553,FUTO students: Ụmụakwụkwọ FUTO tọrọ na Bosnia alọtala na Naịjirịa,Ụmụakwụkwọ FUTO abụọ ahụ bụ Alexandro Abia na Kenneth Eboh ndị mba Kroeshia tụlatara na Bosnia alọtala na Naịjirịa.,"Alexandro Abia na Kenneth Eboh mgbe ha wuchiri n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja Onyeisi kọmiti na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi bụ Abike Dabiri site n'ozi o zitere BBC kwuru na ha batara ọdọụgbọelu dị n'Abuja n'abali Fraịde 20 Disemba, 2019. End of Twitter post, 1 Ụmụaka akwụkwọ ndị a sị na ha gara isonye n'asọmpi Tennis na mba Kroeshia bụ ebe anwụchiri ha ma tụlata ha na mba Bosnia. Dabiri dị na mbụ kwuo na minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Geoffery Onyeama banyere n'ọrụ ozugbo maka ịzọpụta ụmụokoroọbịa abụọ ahụ tọrọ na mba Croatia. Dabiri kwukwara na agbanyeghị na Naịjirịa enweghị ọnọdụ na Croatia mana na ndi ọrụ ha nọ na mba gbara ha gburugburu abanyelarị n'ọrụ ịmata nke bụ eziokwu na ọnọdụ ndị ụmụokorọbịa ahụ. Ụmụakwụkwọ abụọ nke mahadum tekịnụzụ (Federal University of Technology) dị n'Owere tọrọ na mba Croatia ebe ha gara asọmpi tenis. Aha ụmụakwụkwọ a bụ Abia Uchenna Alexandro na Eboh Kenneth Chinedu. Dịka akwụkwọ akụkọ Guardian UK si kwuo, Uchenna na Chinedu gara asọmpi a kpọrọ World Universities Championships. Egwuregwu ha sonyere na ya bụ bọọlụ tebulu (table tennis) Ha kwesịrị ịlọghachi na Naịjirịa n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba. Mana ka ha na-eme obere mkpagharị na mgbede abalị iri na asaa nke Novemba, ndị uweojii mba Croatia nwụchiri ha. Dịka Chinedu si kwuo, ""Ha ekweghị ka anyị baa n'ime ụlọ anyị weta akwụkwọ ikike anyị ji mee njem."" ""Onweghị onye kwere ịṅa ntị n'ihe anyị na-ekwu."" Ndị uweojii ahụ kpọrọ ụmụakwụkwọ abụọ a bufee ha mba Bosnia-Herzegovina. Ogige dị na mba Bosnia-herzegovina ebe a na-edebe ndị mbịarambịara na-enweghị akwụkwọ zuru oke. Ebe ahụ ka e nwere ogbe ebe ndị mbịarambịara na-enweghị akwụkwọ juru. Mmiri adịghị ebe ahụ, ekpomọkụ adịghịkwa ya, na-agbanyeghị n'obodo ahụ na-atụ nnukwu oyi. Ka ọdị ugbua, ụmụakwụkwọ abụọ a ka nọ na Bosnia-Herzegovina. A mabeghi mgbe a ga-ahapụ ha ka ha lọghachi Naịjirịa. Ihe ndị FUTO kwuru BBC Igbo kpọtụụrụ Ọkankuzi Chikwendu Orji onye ji ọkwa 'Dean of Student Affairs' na Futo. Mana o kwuru na ya agaghị asa ihe ọbụla n'ihi na ọbụghị ya ka ọ dị n'aka ikwuchitere mahadum ahụ ọnụ ya. Okweghịkwa ezitere anyị akara ekwentị onye ọ bụ ọrụ ya ikwu okwu. Anyị kpọtụkwaara ndi isi otu jịkọrọ ụmụ akwụkwọ bụ nke a kpọrọ 'Student Union Government'. Mana ha kwuru na ha anụbeghi akụkọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-43242216,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43242216,Dino Melaye: APC na Buhari agbajọọla ndị Naijịrịa,Onye otu Sineti akpọrọ Dino Melaye kwuru na Pati ya bụ 'All progressives Congress' a gbajọọla ndị Naijiria.,"A ma Dino Melaye dịka onye na-ekwuwapụ uche ya gbasara ọchịchi na Naijịria Melaye kwuru na APC emeghị ihe ndị Naijiria tụrụ anya n'aka ha, ka ọtụtụ ndị gbara mbọ hụ na ha tunyere Onyeisiala Najirịa bụ Buhari na ntụliaka e mere na 2015. Onye omeiwu a si na kogi steeti kwuru nke a ụbọchị Toosde gara aga mgbe ọ na-anata nturugo 'onye omeiwu kachasị mma n'afo 2017' nke akwụkwọ mgbasa ozi akpọrọ 'Daily asset Newspaper' nyere ya. Melaye onye kọwara APC dịka ebe mkpesa akpọrọ 'Public Complaints Commission' n'olu bekee, kwuru na Naijịrịa na-arịa ahụ. Buhari banyere ọchichị n'afọ 2015 ""I kwuo eziokwu, ị nwuọ, ị tụọ asị, ị nwụọ. Mụnwa bụ Dino Melaye ekpebiela ikwu eziokwu ma nwụọ."" O kwuru na ndị Naijirịa na-ata ahụhụ na-achị ọchị. O kwukwara n'ọdị mkpa ka ndị a na-achị na-enyocha ihe ndị nọ n'ọchịchị na-eme. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-45301756,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45301756,Conditional Cash Transfer: 'Nye ndị ntorobia N1m' - Peter Obi,"N'uche ya, Peter Obi kwuru na ọ bụ ndị ntorobia gụchara Mahadum ka ego ahụ ga-aka baara uru maka iji hazie onwe ha.","Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye O kwuru na ọ bụghị inye ndị mmadụ puku naịra ise (N5000) maọbụ puku naịra iri (N10,000) ga-egbo mkpa ụbịam na ndụ ndị mmadụ. O kwuru na ihe kwesịrị Naịjirịa ugbua bụ ndị isi ga-ahazi ya bụ obodo na-abụghị ndị ga na-emefu ego ka o si masị ha. Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra. 'Conditional Cash Transfer' bụ atụmatụ ọhụrụ gọọmentị etiti manyere iji nyere ndị ụbịam aka nakwa kesaa ego Abacha e si mba ofesi bulata. Obi na-ekwu na ihe rụrụ pasentị iri isii na ndị ntorobia gụchara mahadum enweghị ọrụ, na ọ bụ ha kwesịrị enyemaka. O kwuru na Naịjirịa ga-ebili ọzọ ma o nwee ndị na-achị ya ọfụma. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49718939,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49718939,Porthacourt Killings: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ,Ndị uweojii na Port Hacourt anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Potakọt.,"Ndị uweojii kwere nkwa na aka ha ga-akpara ndị na-arụ ala ahụ Na nsonso a, a tọgburu opekatampe ụmụagbọghọ asatọ na ndịda Naịjirịa kemgbe ọnwa Julai. N'otu aka ahụ ndị uweojii kwukwara na akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ ọzọ atogburu n'ụlọoriri abụghị eziokwu. Ha kwuru nke a dịka ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọbịa n'ụlọoriri n'obodo ahụ. E butela ozu nwa agbọghọ ọzọ na Pọtakọtụ isi obodo Rivas Steeti. Nke a mere na mgbede ụbọchị ụka, abalị iri na ise nke ọnwa Septemba. Ọ bụghị nke mbụ ụdị ihe a na-eme nke ọ na-abụ nke abụọ. Ajụjụ wee bụrụ onye na-anyụ ihe nke a na-esi? Ndị uweojii kwere nkwa na aka ha ga-akpara ndị na-arụ ala ahụ Ihe gbara gharịị bụ na etu e si gbuo ụmụ agbọghọ ndị ahụ yichara onwe ha. Ọ na-adị ka ọbụ ntọgbu ka a na-atọgbu ha. Ndị uweojii kwuru na a hụrụ akwa e kere n'olu ụmụagbọghọ ndị ahụ e ji tọgbuo ha. Mana onwebeghi onye matara onye maọbụ ndị na-akpa arụ a. Chuks Enwonwu, osote onyeisi ndị uweojii na Rivas Steeti Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivas Steeti bụ Nnamdi Omoni, gwara BBC na nnyocha pụrụ iche amalitela. Omoni kwuru na ha na-eche na e nwere otu ndị ekperima ndị aka ha dị na ihe ọjọọ a na-eme. O kwuru sị: ""Anyị anwụchiela mmadụ ole na ole ga-enyere anyị aka na nnyocha anyị na-eme."" ""Mana anyị ma na anyị kwesịrị ịgba mbọ karaịa."" ""Anyị anaghịzi ezu ike maka na ihe a na-ebuetere anyị ihere."" ""Anyị ga-anwụchi ndị ọbụna aka ha dị na igbu ọchụ ndị a."" Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ n'ọnwa Ọgọst BBC kpọtụkwaara onye isi ndị otu jikọrọ ndị nwere ụlọ oriri na nkwarị na Rivas steeti. Aha ya bụ Eugene Nwauzi. O kwuru na ha na gọọmentị na-arụka ọrị ọnụ iji kwụsị oke ogbugbu a. ""Anyị ga-agba mbọ hụ na ụlọ oriri na nkwari ọbụla nwere ihe ose foto a kpọrọ 'CCTV'."" ""Ndị enweghị ego ịzụta 'CCTV', anyị ga-enyere ha aka ịgbazite ego n'ụlọakụ iji zụta ya."" Ụmụnwanyị emeela ngagharị iwe Ọtụtụ otu ụmụnwanyị na Pọtakọtụ mere ngagharị iwe n'ihi nke a. Otu ndị a gụnyere 'Rotary Club' nke Pọtakọtụ, otu ndị ọkaiwu ụmụnwanyị a kpọrọ 'Federation of Women Lawyers' (FIDA), nakwa otu ndị dibịa bekee ụmụnwanyị a kpọrọ 'Medical Women Association of Nigeria' (MWAN). Ụmụagbọghọ ụfọdụ mekwara ngagharịiwe n'ụbọchị Fraịdee. Ha dọrọ ụmụagbọghọ aka na ntị ka ha kpachapụ anya onye ha na-eso. Ngagharịiwe ahụ gakwara n'ihu n'ụbọchị Monde. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere" afirika-46504346,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46504346,"Atiku, Ezekwesili ebinyela aka n'akwụkwọ 'Peace Accord'",Onye na-azọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar nakwa onye ogbo ya nke ACPN bụ Oby Ezekwesili ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ụdọ na ntuliaka 2019.,"Atiku na Ezekwesili mere nke a ụbọchị Wenezde oge ha gara(iche iche) n'ụlọọrụ National Peace Committee dị n'Abuja. Cheta na Mmadụ abụọ a kwuburu na e ziteghị ha ozi bịa ọgbakọ maka mbinyeaka aka na nkwekọrịta i mee ka udo chịa na ntuliaka na-abịanụ. End of Twitter post, 1 Mana otu kpokọbara maka ya bụ mbinyeaka zọrọ isi onwe ha kwuo na ha zigara ndị na-azọ oche onyeisiala ruru iri asaa na atọ n'ime pati iri itoolu na otu ozi. Gịnị dị n'ime akwụkwọ 'Peace Accord' a? Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị oru ya bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 kwetara; Onyeisiala Muhammadu na ụfọdụ ndị otu pati ndị ọzọ binyere aka na ya bụ akwụkwọ udo ma na-ekwe nkwa na ọ ga-agba mbọ hụ na ihe gara nkeọma na ntuliaka na-abịanụ. Akwụkwọ udo ga-eme ka ndị na-azọ oche ọchịchị kwe nkwa na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi udo obodo na ntuliaka na-abịanụ Akwukwọ nkwekọrịta udo ma a na-eme ntuliaka na 2019 gụnyere na onye ọbụla na-azo oche ọchịchị agaghị eme ihe ọ bụla ga-ewepụ udo n'obodo. Ha kwekọrịta na achụm nta vootu ha ga-abụ ihe wulite mmụọ ụmụ Naịjirịa ma gwa ha etu ha ga-esi gbanwe ọnọdụ ha ma ha banye ọchịchị. ""N'ime nkwa a anyị na-ekwe, anyị agaghị akatọ okpukpe onye ọbụla anyị na ya na-azọ oche ọchịchị."" Gịnị dị n'ime akwụkwọ 'Peace Accord' a? Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị oru ya bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 kwetara Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-45109003,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109003,Visa: Gọọmentị etiti akwụsila ịnye ndị inginịa mba ofesi akwụkwọ,"N'iji wee hụ na ndị ntorobia enginia sitere na Naịjirịa nwetachara ọrụ nke ọma, gọọmentị etiti akwụsịla ị nye ndị inginia mba ofesi akwụkwọ njem ị bata Naịjirịa rụọ ọrụ.","Mmekọrita ndị inginia mba ofesi nakwa nke ndị Naịjirịa na-eweta oke ọmụmụ. Ha kwukwara na ha e wepụtala iwu ga-ahazi ngalaba na-ahụ maka ihe nrụpụta na Naịjirịa. Minista na-ahụ maka mmiri bụ Suleiman Adamu bụ onye nọchitere anya onyeisiala Muhammadu Buhari n'emume ndị inginia kwuru na ministri na-ahụ maka nhazi Obodo bidoro mmanye mkpebi a nke so na iwu onyeisiala wepụtara. @Ade_Gokay sị na mkpebi a amaka makana ọ bụchaghị ndị inginia niile si mba ofesi bụ ezigbo ya. Buhari na-ayọkwa Mahadum ndị nọ Naịjirịa ka ha wulite etu ha si akụzị inginiaring ka ndị inginia a zụrụ ebe a ka ndị a zụrụ na mba ofesi mma. Mana mgbe BBC gbara otu onye inginia bụ Azubuike Agbasi ajụjụ ọnụ gbasara ya bụ mkpebi.o kwuru na ọ ga-emebi ihe nke ukwu na Naịjirịa. Agbasi kwuru na kama a ga-akwụsị ị nye ha akwụkwọ njem nchanacha, ka e bie nke nke ndị a na-enye. O kwukwara na ọ ga-adịmma ma enye sọsọ ndị inginia ukwu akwụkwọ njem makana ha ga-enyere aka n'ọzuzụ ndị inginia na-eto eto na Naịjirịa. Mana onye engineer so n'otu akpọrọ ""Council for the Regulation of Engineering in Nigeria"". (COREN) na-achọghị ka akpọpụta aha kwuru na ya bụ mkpebi dịmma makana ọ ga-eme ka ndị inginia Naịjirịa nweta ọrụ ndị ọcha na-abata obodo a bia anara ha. O kwukwara na o ga-eme ka ha tinye uchu n'ihe ha na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49347423,https://www.bbc.com/igbo/49347423,Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah,Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah bụ nwa afọ Saut-Afrika bụ ọkpaọchị a ma ama na mba Amerịka.,"Damini Ebunoluwa Ogulu a ma díka 'Burna Boy etiela ótútú egwu gúnyere 'Like to party', 'Burn Identity' Nke mere ụmụ Naijiria jiri kpụrụ ya na Trevor n'ọnụ. End of Twitter post, 1 Burna Boy, onye gụrụ egwu ya a kpọrọ ""ye"" nakwa ""Anybody"" n'ihe emume Noah gosiri na ọ bụ ezigbo nwa Naijirịa ka ọ wuchiri. Ka nwa amaadị a ritere nzere ""BET international act afọ 2019' na Trevour kelechara, ihe pụrụ ya n'ọnụ bụ ""How una dey now?"" Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha Ọ kọọkwara Noah etu ya siri zute ya mbụ na Saut Afrika n'afọ 2014. Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a ""Anyị na-achọ ịbanye, ebe Trevour na-achọ ịpụta. Ndị mmadụ na-eti ""Trevor! Trevor"" Mr Raw: Ihe mere m jiri e ji Igbo eme 'rap' Nwaanyị m na ya so gaa jụrụ biko a chọrọ m ị ga-kelee Trevour ma agbọja ya, 'nọọ ebe ịnọ."" Akụkọ ya tọrọ Trevor nnukwu ọchị dịka o kwuru na ọ bụrụ ụfọdụ mmadụ, ha ga-eji maka ihe ahụ mere bido kpọwa ya asị. Morocco nwa Maduka: Trevor Noah: Kedụ ihe mere egwu Naijiria nakwa egwu si Afrịka ha ji achake n'ụwa niile ugbua? Burna Boy: Ihe niile na-alaghachi ebe o si. Ọ bụ maka na egwu si n'Afrika bịa, egwu na-alaghachịkwa n'afrịka ebe o si. ""Mgbe ihe niile mebichara, onye ọbụla alawa. Trevor Noah: Ị kpọrọ egwu gị ' Afro fusion' gịnị bụ 'Afrofusion.' Burna Boy: ""Afrobeat dịka 'pizza,ntọala ya bụ 'flour', i nwere ike ifenye ya 'hip-hop' maọbụ 'pepperoni' maọbụ 'dancehall' bụzị ihe ndị a na-etinye ya were nweta ụdị egwu ị chọrọ."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44410034,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44410034,Chekwas Okorie agwala gọọmentị ka o kwanyere Humphrey Nwosu ugwu,Nwafọ Igbo bụ onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chekwas Okorie etinyela ọnụ n'okwụ ndị kwuru na nkwanye ugwu na nturu ugo nke awọrọ Humphrey Nwosu dịka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo.,"Chekwa bụ onyeisi United Progressive Party zọbụrụ ọkwa onyeisiala Naịjirịa Ọ sị na ntuliaka aka ahụ Humphry Nwosu mere bụ nke ụwa nịịle kwetere na ọ bụ ọkacha akacha na ntụlịaka emegoro na Naịjirịa kwesiri ị nweta nkwanye ugwu pụrụ iche. Ọ sị na Nwosu bụ nwafọ Igbo nwere obisiike na ikpe nkwumọtọ na-enweghị ogbo, agbanyeghị na ọ nọ ọdụ ka ndụ ya adabere adabere mgbe ahụ dịka ndị amị sịrị sochie ya azụ. Na onu ya, onweghị onye kwesiri nturu ugo karịa nwaamadị mere otu a. Ọ sị na emeghị ya bụ nwata ka emere ibe ya dịke Igbo kwuru na okwu. Okorie sị na ""Nwanne anyị bụ Prof. Humphrey Nwosu kwesiri ịkwanyere ugwu pụrụ iche ebe ọ bụ na-ometula ndị ọchịchị aka n'obi icheta ndị kwụsiri ike n'ezi okwu"". Ọ sị na nke a ga-eme ka ọchịchị onye kwuo uche ya gwudosie ike na Naịjirịa agbanyeghị mbọ nịịle ndị ajọọ mmadụ gbara megide ya bụ usoro ọchịchị. Ọ mere ka anyị cheta na ọ dịka achọwara ya bụ onye ọkammụta achọ mgbe ahụ mana nke a emeghị ka ọ laa azụ na-eziokwu ikwuputa na ọbụ MKO Abiola bụ onye nwere mmeri na ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị. N'ihi ya, o kwesiri ị kwanyere ugwu n'ụzọ pụrụ iche. Ọkorie sị na-ekwesilarị ịme nke a kemgbe n'ihe na-aka jị ihe ahụ ọmere amatụ ruo taa, ""onwebeghị onye mere ihe yiri ya kemgbe ahụ"". Ọkwusikwara ike na ọbụrụ na-akwanyeghịrị ya ugwua na ""ọ bụ mmegide maka na ọ bụ onye Igbo"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49635967,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49635967,"South Africa Xenophobia: ""Ihe e mere anyị bụ ihe nyere anyị mbọ mbọ ọsọ na South Africa""- Nwaanyi Igbo si SA alọta","Nwaanyi na-achọghị ka edepụta aha ya ekwuola ihe mere o ji kpọkọrọ ezinụlọ ya, si mba Saụt Afrịka na-agbalata Naịjirịa.","South Afrịka Killings: ""M na di m na ụmụ atọ anyị na-agbalaga"" Nwaanyị ahụ kwuru na ọ bụ oke mkpagbu ndị Saụt Afrịka na-emeso ndị mbịarambịara na-eme ka ndị mmadụ gbapụ n'obodo ha. O kwuru na ọ kara ya mma na ya na ụmụ atọ ya gbalagara zọta ndụ ha karịa ma ikwe ka ndị Saụt Afrịka were iwe na ọnụma meruo ha. Etu ihe si kwụrụ ugbua na nhazi a na-eme maka ndị Naịjirịa chọrọ i si Saụt Afrịka lọta Onye nnọchiteanya Naịjirịa na Johannesburg bụ Godwin Adama kwuru na ihe karịrị mmadụ narị isii edenyela aha isonye ụgbọlelu e ji bụla ndị chọrọ i si Saut Afrịka laghachị Naịjirịa. O kwuru na ụgbọelu Peace abụọ ga-amalite ịbụlaga ndị a n'ụbọchị Wenezde. Adama kwuru na ya na ndị otu ya na-agba mbọ ị hụ na ndị Naịjirịa chọrọ ịlaghachite denyechara aha n'akwụkwọ. O kwuru na ndị nọ na nga agaghị esonye na ya bụ atụmaatụ makana ebe ha nọ enweghị nsogbu mana ụfọdụ ndị n'ụlọ ndị a chọrọ ịgbara ụgbọ nwa mkpị ga-esonye. Adama kwuru na ha na-edekọ aha ndị niile e mebiri ụlọ ahịa ha ka ha wee mara etu ọzọ ha ga-esi mee ihe gbasara ndị a. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51904229,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51904229,Coronavirus: Idris Elba ebutela coronavirus,Onye na-eme ihe nkiri a ma ama bụ Idris Elba ebutela coronavirus dịka o si kwuo n'akara soshal midia ya.,"End of Twitter post, 1 Elba sị na e nyochara ya n'ụtụtụ taa ma chọpụta na o bu ọrịa coronavirus. O kwuru na ya na onye bu ọrịa a nwere mmekọ ahụ n'ụbọchị Fraịde. Ọ sị na onwebeghi etu ahụ si eme ya ugbua mana ọ gbachiela onwe ya n'ụlọ maka nke a. Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ na-asa aka oge ọbụla ma dosa ebe ha bi ọcha mgbe niile. Mba Briten amachiela ime njem, ọgbakọ maka coronavirus Boris Johnson, onyeisiala mba Briten agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ bi na UK kwụsị ịme njem na-adịghị oke mkpa bụ nke ga-ebenata mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha maka mgbasa Coronavirus dịka ọnụọgụ ndị nwụgoro na ya bụ ọrịa rugoro iri ise na atọ. Johnso kwuru ka onye ọbụla nwere ike sị na ụlọ ha na-arụ ọrụ dịka otu n'ime usoro ọhụrụ gọọmenti wepụtara iji buso ọrịa a agha. O kwuru ka ndị rugoro afọ iri asaa nakwa ndị ahụ esichaghị ike nwere okwuo kpọrọ ihe. Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akwụsịla nchutu Adams Oshiomole dịka onyeisioche pati All Progressive Congress. N'ikpe ndị ọkaikpe atọ nke ọkaipke Abubakar Yahaya nọ n'isi ya chabiri n'ụbọchị Mọnde, kwuru ka nchutu Oshiomole nke ụlọikpe ukwu nyere iwu ya kwụsị. Ụlọikpe a sị na iwu a ga-adị ruo ụbọchị Fraịde mgbe a ga-eleba anya n'akwụkwọ Oshiomole gbara. Cheta na ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị 4 Maachị ka Oshiomole kwụsị igosi onwe ya ka onyeisi APC. Nlele nke mbụ ọgwụ mgbochi coronavirus ga-amakite ụbọchị Monde na mba Amerika, dịka anyị nụru. Mmadụ iri anọ na ise ahụ dị mma ekwetala ịnara ya bụ ọgwụ n'ụlọ ọchacha dị na Kaiser Permanente, Seattle. Ya bụ ọgwụ nwere oyiri ya bụ nje dị na ya mana ya bụ nje ezughị ibute ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ ka ga-ete aka tupu amara ka ya bụ ọgwụ maọbụ ọgwụ ndị ọzọ na-emepụta ọ ga-arụ ọrụ. Ndị ọrụ Sayensi n'ụwa gbaa gburu na-agba mbọ ịmata ka ha aga emepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a ngwangwa. Ndị weputere ego maka nnwale ọgwụ a nke mbụ n'ahụ mmadụ bụ ndị National Institutes of Health sị na ha mafere usoro nke mbụ e si anwale ọgwụ mgbochi bụ nke na-enye aka ịmata ka ya bụ ọgwụ ọ ga-adịkwa ire n'ahụ mmadụ. Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ya bụ nchọcha bụ Moderna Therapeutics sị na usoro eji mepụta ya bụ ọgwụ bụ usoro e ji emepụta ọgwụ mgbochi kemgbe ụwa. Na Lọs Angelis dị na New Yọk dị Amerịka, ọ bụ emechiela ebe a na-ere nri na mmanya. Ghana, Kenya, Saụt Afịrịka nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ amachiela ndị si mba nje fesara ọfụma ịbata. Saụt Afrịka na Sierra Leone emechiela ụlọakwụkwọ. Moroko amachiela ụgbọelu si mba ofesi ịbata mba ahụ. Nke mere ka ụfọdụ na-aju ihe ji Naịjirịa. Onye nọ na ""Parklane' Enugwu enweghị coronavirus - NCDC Ngalaba na-ahu maka mbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na nyocha e mere onye eche na o nwereike buru coronavirus n'Enugwu gosiri na ya bụ nje adịghị ya n'ahụ NCDC sị na ọ dị mkpa ichere ka emecha nchoputa tupu ndi mmadụ eburu asịrị kpagharịwa. Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ otu nwaanyi si ofesi lọta ka a na-eme nyocha makana ọ na-akwa ụkwara. N'otu aka ahụ, Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi bụ onye odeakwụkwọ kọmịsọna ahụike n'Enugwu, site n'akwụkwọ o nyere ndị mgbasaozi, kwenyekwere n'ihe NCDC kwuru ma sịkwa ka ndị mmadụ ka na-adị ọcha ma na-agbado anya. Buhari sị ndị mberede metụtara n'Abule Ado ka Eluụlọ dị n'okirikiri ebe ahụ kụsasịrị Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etiela ndị igwe gassị gbara ka ogbunigwe na Legọs metụtara aka n'obi. Ọ sị na NNPC na-agba mbo ịchọpụta ihe kpatara ya bụ mberede. Ngalaba gbata gbata na Legọs kwuru na ha butere ozu mmadụ iri na asaa nwụru na ya bụ ọdachị ebe mmadu iri abụọ na ise merụrụ ahụ. Joe Biden na Bernie Sanders zutere Joe Biden na Bernie Sanders ji Donald Trump mere okwu ka ha zutere n'ogige achụmta vootu onye ga-ebu kọlọtọ pati demokrat zọzị ya ọchịchii n'ọnwa Novemba. Ha abụọ sị na Trump ezughi ka emee ma ncha, ọkachasị etu o si ebuso Coronavirus agha. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48149209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48149209,Coal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha,Otu n'ime omenala njirimara Igbo bụ iti mmọnwụ.,"Coal Camp Enugwu sọ na ndị eji mmọnwụ mara. Mgbe gboo, Coal Camp so na ebe a na-abịa ekiri mmọnwụ dị icheiche ma emewe emume. Agbawa ihe dịka ekeresimesi, emume afọ ọhụrụ maọbụ Easter, Coal Camp na ejueju bara abara na mmọnwụ. Mana omenala a mechere lawa nke bụ na anaghịkwa ahụ mmọnwụ ọbụla ma emewe emume na Coal Camp maọbụ Enugwu gbaa gburugburu. Ugbua, ndị Coal Camp tetere n'ụra kpebie ịmalịte ya bụ omenala njirimara ha. Nke mbụ ya ka ị ga ekiri ebe a. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-53783719,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53783719,Barcelona na Bayern Munich: Bayern Munich adọkaala ọbante ndị Barcelona n'ime ahịa,Bayern Munich ataala Barcelona ahụhụ mmehie ha n'asọmpi Champions League nke ha gbara n'abalị Fraịde.,"Goolu ise chara acha ka Bayern Munich nyerela n'asọmpi a n'agbanyeghị na ọbụ agba nke mbụ ka a gbarala. Mana otu n'ime goolu ahụ Bayern nyere bụ n'ime goolu nke ha, dịka David Alaba nyere onwe ya goolu. Muller nyere goolu abụọ, Gnabry enye otu ebe Perisic nyere nke ọzọ. Bayern Munich na Barcelona Oge agba nke abụọ malitere, Lewandoski nyekwara otu goolu mana a kachapụrụ ya n'ihi na ọ nọ 'offside'. Luiz Suarez mechara nyetere Barecelona otu goolu, mana Kimmich nyekwara goolu ọzọ iji mee ya 5-2. Lewandoski mechara nyete goolu nke ya, ebe Coutinho batara nye goolu abụọ. Cheta na Coutinho gbaburu bọọlụ na Barcelona tupu ọ pụọ. Nke a pụtara na ọ bụ ọkpụ asatọ a satara naanị abụọ ka Bayern ji merie Barecelona iji ruo agba nke ikpeazụ nke Champions League afọ 2020." afirika-44804056,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44804056,Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ,"Ụlọikpe pụrụiche na-ahụ maka ihe banyere iyi ọha egwu bụ nke Bekee kpọrọ ""terrorism"" tụrụ mmadụ 113 mkpọrọ maka ha dara iwu megidere iyi ndụ egwu.","Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ndị a amara ikpe nwetere oge dị icheiche mgbe akpụpụtara ha n'ụlọikpe pụrụiche dị n'ọdọ ndị agha Naịjirịa dị na Kaịnji, Naịja steeti. Iwu a sịrị ndị a dara gunyere ị so n'otu Boko Haram, izo ozi ga-enyere ndị ọrụ nchekwa obodo aka, inyere ndị otu oyi egwu aka ma soro mee ihe ga-eyi obodo egwu, nke butere ogbugbu mmadụ. Ndị ikpe a metụtara gụnyere Kabiru Mohammed, bu onye Kaban-Magadan, dị na Funtua, Katsina steeti. Eboro ya ebubo na azụru ya maka iji ogunigwe na ihe iyi egwu ndi ọzọ. Ndị nchekwa kwukwara na o so mkpa ike na Bama, Konduga, na Baga dị na Borno steetị nakwa Damaturu dị na Yobe steeti. Mohammed kwuru na ya banyere Boko Haram n'afọ 2013 ma bụrụ onyeisi. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009 E kwuru na o du ndị ọzọ ga mwakpo mmadụ na obodo. Mohammed gbakwara ama na ọbụghị mmadụ kwanyere ya ịba Boko Haram, mana onwere mgbe ike ụdịrị ndụ ha na-ebi gwụrụ ya ike, nke mere ojiri tụfọ egbe ya wee gbaje Katsina. Anwụchịrị ya na 2015 n'ọdọ ụgbọala na Katsina. O kwenyere na ebubo asaa eboro ya nke mere eji tuọ ya mkpọrọ mkpụrụ ọka ruo afọ 30. Ụfọdụ ndị ọzọ atụrụ mkpọrọ bụ Adamu Mohammed dị afọ 22, ma bụrụ onye Gombe steetị. Eboro ya ebubo na o gburu mmadụ isi ma tụọ ogbunigwe n'ime ahịa. Mohemmed kwenyere na ya gburu mmadụ isi, ma kwuo na ọ bụ n'ime iyi ka ọ tụnyere ogbunigwe ahụ. Ya na onwe ya nwetere afọ 25 na mkụrụ ọka. Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ Banzana Yusuf, bu onye Kano, nwetere afọ 20 maka etu aka ya siri dị na ntọrọ umu Chibok n'afọ 2014. Otu onye ndị DSS kpọrọ ""ezigbote onye Boko Haram"" bụ Sabo Kyari Mohammed, nwetere afọ isi na mkpọrọ. Ekwụrụ na Mohammed na-agbara ndị Boko Haram ama ma soro mee mwakpo akpọrọ ""operation pointand kill"" na Bekee na obodo ya bụ Misau di na Borno steeti. Ndi agha nwụchịri ya na nwụnye ya na umu ya na Platu steetị. Zainab Idris, bụ nwunye onye isi agha Boko Haram akpọrọ Babawo, sọ na ndị a amara ikpe. Anwụchịrị Zainab Idris ka ọ na-aga Sambisa, bụ ebe di ya nọ. Gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na ha emeriela Boko Haram n'atụtụmatu Bekee kpọrọ ""technical deafeat"", mana otu a ka na-akpa ike na ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa. Ndị ọzọ na-akpa ike na Naịjirịa ugbua bụ ndị a na-eche na ha bu ndị Fulani na-achi ehi. Ọtụtụ mmadụ anwụọla na-aka ndị a na ebe dị icheiche na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51979310,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51979310,Nkịta karịrị 50 nwaanyị na-azụ ewerela ya mere nri n'Abakpa Nike dị n'Enugwu,Njinji jiri na Abakpa nike dị n'Enugwu oge otu nwaanyị gbara afọ 75 aha ya bụ Ada Young lara mmụọ n'ihi na e chere na nkịta karịrị 50 ọ na-azụ n'ụlọ ya eriela ya ma rachaa ọnụ.,"Ya bụ ihe ịgba anya mmiri mere na mkpụrụ ụbọchị ole ma ole gara aga. Dika BBC siri chọpụta, nwaanyị ahụ nwere ụlọ n'Abakpa enweghị di nke ọ na-enwe nwa ọbụla. Ndị tenanti bi n'ụlọ ya kwuru na nwaanyị nwụrụ anwụ bụ Ada Young enweghị enyi nke ọ ma enwe onye ọbụla na-aba n'ụlọ ya. Otu onye na-azụ ahịa eletrọnik n'ala ụlọ nwaanyị ahụ Buchi Michael kọwara na ọgbagwojuru ya anya ka ụmụ nkịta ahụ siri gbuo ""land lady"" ya n'ihi na ọ na-amụ nkịta ndị ahụ ụmụ ya. Michael kọọrọ anyi na ọtụtụ mgbe ka nkịta na-ata ya bụ nwaanyị mana ọ naghị akọsara mmadụ ihe mere ya. Ụbọchi ahụ mkpa mkpa kpara bụ na ihe karịrị shọp 30 nọ na-ala ụlọ ya kwuru na onwere ihe ma-esi na ụlọ ahụ, tinyekwara na ha ahụbeghị land lady ha ka mgbe week abụọ. Nkea mere ha na ndị agbata obi ha jiri ga ikwu nne nwaanyi ahụ nụ Mile Enugwu kpọta ndị obodo ha ka akụwaa ya bụ ụlọ. Ọtụtụ ndị agbataobi kwuru na ọbụzị ka akụwara ụlọ ka ahụrụ ozu nwaanyị ahụ ka ụmụ nkita ahụ na-eri ya. Ka ọ dị ugbua, ndị Nike eburula ihe fọrọ n'ozu nwaanyị ahụ, nke ekwuru na ọbụ sọsọ isi ya fọrọ were laba na be ha. Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ya bụ akụkọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-47807772,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47807772,Chelsea vs Brighton: Chelsea etiela epele n'isi Brighton,"Otu egwuregwu Chelsea, Man City na Tottenham e werla ndị ogbo ha Brighton, Cardiff na Crystal Palace zụọ epele n'asọmpi Ịnglish nke a ma ka English Premier.","Chelsea ji ọkpụ goolu atọ chara acha asataghị otu merie ndị Brighton & Hove Albion na ọgbọ egwuregwu ha bụ Stamford Bridge. Ọ bụ Olivier Giroud, Eden Hazard na Ruben Loftus-Cheek nyere Chelsea goolu na nkeji 38', 60', na 63' n'usoro. Dịka ọ dị ugbua, Chelsea ji ọnụọgụgụ 63 nọrọ na ndị ise n'ogogo tebụlụ asọmpi premier lig. N'ebe ọzọ Cardiff City ji nkata kpọrọ goolu abụọ n'aka Manchester City. Kelvin De Bruyne na Leroy Sane enyere goolu ha na nkeji 6' na nkeji 44' n'otu usoro. Manchester City ka bụ ndị mbụ na tebụlụ n'ọnụọgụgụ 80. N'otu aka ahụ Tottenham sara ndị Crystal Palace isi site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ. Goolu ha si n'aka Heung-Min Son na nkeji 55' nakwa Christian Erikson na nkeji 80'. Mmeri a dosara Tottenham na ndị atọ n'ogogo Tebụlụ ebe ha ji ọnụọgụgụ 64. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50402459,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50402459,Ebola Vaccine: Chukwu azaala ekpere Afịrịka,Otu ahuike mba ụwa akwadola otu n'ime ọgwụ ndị arụpụtara maka iji gbochie ọrịa ebola.,"Ebola bịara na Naịjirịa na 2014 mana gọọmenti Naịjirịa jidere ya nkeọma World Health Organisation kwuru na nke a ga-enye aka iji hụ na ọrịa ọjọọ a kwụsịrị ịgbasa n'ọtụtụ mba Afịrịka dị icheiche ebe ya bụ ọrịa na-akpa mkpamkpa ugbua. Nkọwa gbasara ọgwụ mgbochi Ebola a WHO depụtara n'akara webusaitị ha na ọ bụ ụlọ ọrụ Merck na-emepụta ọgwụ na mba United States ama ama n´ụwa niile rụputara ya bụ ọgwụ mbochi na ọgwụgwọ. Ha kọwara na a na-agba ọgwụ ahụ bụ Ervebo dịka ọgwụ ọgbụgba. WHO kwuru na nke a bụ otu ụzọ n'ime ọgwụ ọzọ a ka na-enyocha ka ọgwụ ga-agwọ ma gbochie Ebola ba ụba n'ọdịnihu. Ha kwuru na a ga-ebido nwetawa ya bụ ọgwụ n'etiti afọ 2020. Ebola emeela arụ! Ka anyị chetara unụ ihe ụnụ kwesiri ma maka ọrịa a Mana n'ime ihe niile a , ụmụ mmadụ g-ekutu ume na enwela ọgwụ ga-egbochinwu ma gwọkwa ya bụ ọrịa. Akụkọ ga-masị gị" afirika-48438357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48438357,May 29 2019 in Nigeria: Mbanye ọchịchị ọhụrụ,Oge akara aka eruwo! makana agha akara aka anaghị eri ngwọrọ.,"A na-enyefekarị aka ọchịchị n'ọnwa May 29 ma emecha ntụliaka onyeisiala Taa onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Tanko Mohammed ga-edu onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo n'iyi ọrụ n'emume pụrụiche a ga-eme n'ọgbọ Eagles' square dị n'Abuja. Ị ga n'ọgbọ egwuregwu Eagle Square ị ga-ahụ na o yi uwe ọhụrụ maka emume nyefeaka ọchịchị taa. Na steeti ruru iri abụọ na itoolu, a ga-edukwa ndị gọvanọ n'iyi ọrụ. Ụfọdụ n'ime ha na-enyefe ọchịchị n'aka ndị ọzọ, ebe ụfọdụ na-abanye agba nke abụọ ha n'ọchịchị. Lee Gọvanọ ndị a na-edu n'iyi ọrụ taa Okezie Ikpeazu (Abia), Ifeanyi Ugwuanyi (Enugu), Dave Umahi (Ebonyi), Ifeanyi Okowa (Delta), Emeka Ihedioha (Imo) Nyesom Wike (Rivers), Udom Emmanuel (Akwa Ibom), Ben Ayade (Cross River), Babajide Sanwo-Olu (Lagos), Seyi Makinde (Oyo), Adedapo Abiodun (Ogun), Darius Ishaku (Taraba) Samuel Ortom (Benue). Nasir El-Rufai (Kaduna), Abdullai Gandu- je (Kano), Aminu Tambuwa (Sokoto), Mohammed Mattawale (Zamfara), Atiku Bagudu (Kebbi), Mohammed Bala (Bauchi), Solomon Lalong (Plateau), Ahmadu Finitri (Adamawa), Babagana Zulum (Borno) Mai Mala Buni (Yobe). Aminu Masari (Katsina), Muhammad Yahaya (Gombe), Abdulrahman Abdulrazaq (Kwara) Muhammad Badaru (Jigawa), Abubakar Bello (Niger) Abdullahi Sule (Nasarawa). Gọvanọ ndị dịka Seriake Dickson (Bayelsa), Yahaya Bello (Kogi), Kayode Fayemi (Ekiti), Rotimi Akeredolu (Ondo), Godwin Obaseki (Edo), Willie Obiano (Anambra) nakwa Gboyega Oyetola (Osun) ka nọ n'ọkwa ha. Soro anyị na Facebook anyị bụ ""BBC News Igbo"" nakwa Website anyị bụ ""BBC.com/Igbo"" dịka anyị ga-agba mbọ wetere gị emume ndị ka o si agaa taa n'akụkụ Naịjirịa dị iche tụmaadị na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-43144354,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43144354,Billy Graham anwụọla,"Billy Graham, onye amama n'izi sa ozi ọma nke Christ anwụọla.","Billy Graham bụ onye ozi ama ama na America Ọ bụ onye na-ekwuchitere Ezinụlọ ya kwuru nke a. Graham dị arọ iri itoolu na itoolu wee nwuọo. Ọ nwụrụ na be ya n'ụtụtụ a. Dika onye mgbasa ozi Christ na America,Graham so na ndị ama ama gbapụtara mgbasa ozi nke Christ na Mba ahụ. Onye mgbasa ozi a bidoro nzụkọ nchegharị na arọ 1940 we mecha bụrụ onye ndụmọdụ ndị isi mba dị iche iche." afirika-44672489,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44672489,Ị chọrọ ịtụ votu na 2019? Lee ihe ga-eme,"Nnenna Okoronkwo bụ onyeisi ngalaba nhazi INEC, kwuru na ndị Naịjirịa asaala anya ugbua n'ihe gbasara ntuliaka karịa etu ọ dị na mbụ.","INEC na-ekwe nkwa na ha adịla nkwadobe maka ntuliaka 2019 Ọ gwara BBC Igbo na ndị ụlọọru ha dị nkwadobe maka ịnabata ọtụtụ ndị Naịjirịa chọrọ ịnata PVC maka ịtụ votu na ntuliaka 2019. Okoronkwo kwuru na oge ka dị maka ndị chọrọ idenye aha n'akwụkwọ maka ntuliaka a. Gere ihe o kwuru maka isiokwu a n'uju ebe a: 2019: Anya asaala ndị mmadụ, ha na-ekwote ịnata PVC - INEC N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuputala uche ha gbasara ya bụ okwu. Onye otu APC bụ Joe Igbokwe, kwuru na etu ndị Naijiria siri teta n'ụra dị mma makana ọ ga-enye aka ime ka ọtụtụ mmadụ binye aka n'akwụkwọ ntuliaka a. O kwukwara na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa chọrọ Buhari ha tunyere ya, mana ọ bụrụ na ha achọghị ya ha tunyere onye ha chọrọ. Onye otu pati PDP bụ Ike Abonyi, kwuru na etu ndị mmadụ si sapee anya ha ugbua chọwa ịnweta PVC ha bụ ihe ọma. O kwukwara na ọ bụ maka etu ndị otu pati ya si kpọkuo ndị mmadụ mere ha ji pụta n'igwe ịnweta PVC ha. Ọ gwara BBC Igbo na ihe na-eme na Naịjirịa ugbua na-ata arụ, ya kpatara ndị mmadụ ji agba mbọ ihụ na ha ji votu ha wee wepụ ndị nọ n'ọchịchị ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53538675,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53538675,Arthur Eze na Anyim Pius Anyim: Gịnị na-esere ha? Lee ihe anyị ma,Kamgbe izuụka ole na ole ka aha Authur Eze bụ nwafọ Igbo ji ego achụnta ego malitere iwu na soshal midia maka ihe o kwuru banyere onye Igbo ịchị Naịjirịa n'afọ 2023.,"Eze nọọrọ n'obodo ya dị n'Ukpo, Dunukofia nke Anambra Steetị sị na onye Igbo ịchị Naịjirịa dị n'aka Chineke kama na ndị Igbo kwesịrị ibu ụzọ hụ onwe ha n'anya. Ọ gara n'ihu kọwaa etu ndị Hausa si nyere ya aka site n'inye ya ọrụ ngo nakwa itinye ya n'azụmaahịa mmanụ Agbidi, na onweghi onye Igbo ga-emenwu ya. Eze ji Pius Ayim bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti n'ọchịchị Goodluck Jonathan maa atụ sị na onweghi ihe o ji ọkwa ahụ mere ndị Igbo. Kama na ihe Anyim mere bụ ịkpọ ndị ọrụ Julius Berger ka ha rụọ ukporo gawara n'ụlọ ya, ebe ụzọ ndị ọzọ dị n'ọwụwanyanwụ adịghị mma. Eze sị na ugbua ọ bụ onyeisiala Buhari na-arụ ụzọ ndị a tinyere akwammiri Naịja nke abụọ. Okwu ndị a Eze kwuru wutere ọtụtụ ụmụafọ Igbo ọkachasị Pius Anyim bụ onye ọ kpọrọ aha. Nke a mere Anyim ji dere Eze akwụkwọ ozi bụ nke e bipụtara n'ihu akwụkwọ ntaakụkọ n'ụbọchị abụọ gara aga. Anyim sị na ihe na-ewe Eze iwu bụ na o nyeghi ya ọrụ ngo mgbe ọ ji ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị etiti. Ọ sị mgbe o malitere ọrụ a na Eze kpọ otu nwoke bịa n'ụlọọrụ ya, ma rịọ ya ka o mee ka e nye nwoke ahụ ọrụ ngo ịrụzi isiụlọọrụ ndị 'Code of Conduct Bureau'. Mana ọ gwara Eze na ọ ka malitere ọrụ ọhụrụ na ọ mabeghi etu ihe si aga, kama na ọ gaa tinye akwụkwọ ọrụ dịka usoro iwu si dị. Ọ sị na Eze hapụrụ ụlọọrụ ya pụọ, na ọ maghị ihe o mere mana nwoke ahụ mechara nwete ọrụ ngọ ahụ. Anyim sị na ọ bụ kamgbe ahụ ka Eze malitere ịgba ya mgba okpuru nakwa imetọsị aha ya n'ọha. Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Anyim gwara Eze bụ na ọ na-ebere n'ahụ Jonathan mgbe ọ na-achị dịka ijiji, ugbua na o bere n'ahụ Buhari na-akatọzi ọchịchị Jonathan. Ọ dị ka a ga-asị na ihe a Anyim dere wutere Eze ma baa ya n'ụmịị nke mere o ji zaghachị ihe niile a Anyim dere n'akwụkwọ ozi. N'ozi si n'aka ndị mgbasaozi Eze nke Okpala Okechukwu tinyere aka na ya sị ọsịsa a Anyim dere gosiri na ọ na-emere Eze anyaụfụ. Ọ sị n'agbanyeghi na Anyim arụọla ọrụ na gọọmentị dịka odeakwụkwọ nakwa onyeisi ndị sịnetị na o nweghi ihe o ji ya mepụta iji tụnyere Eze. Presidency 2023: A na-akpapụ ndị Igbo na Naịjirịa - Ezeife Ọ sị na Eze enyerela ọtụtụ ndị mmadụ aka site n'itinye ha n'ọrụ kamgbe ọ gụchara akwụkwọ na mba Amerịka. Ọ gara n'ihu kwuo na Anyim bụ ihe iyi ndụ egwu nye ndị Ebonyi bụ steetị ya mgbe o ji ọkwa onyeisi ndị omeiwu. Na Anyim bụ onyeisi ndị sịnetị si ala Igbo kachasị njọ, na onweghi uru o ji ọkwa ahụ baara ndị Igbo. BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete ozi n'aka ndị abụọ Igbo ji eme ọnụ bụ Arthur Eze na Pius Anyim ka a mara ""etu mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ"" Akụkọ ka na-abịa... Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 42900258,https://www.bbc.com/igbo/42900258,Obasanjo egwuzobela otu ọhụrụ a kpọrọ CNM,"Dịka a na-ele anya n'ihu maka ntuliaka 2019, pati dị icheiche ekpokobala mwulie pati ọhụrụ ebe onye chịburu ala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo gwuzobere otu ọhụrụ ọ kpọrọ ""Coalition for Nigeria Movement"" .","Ha ji ụdị ihe osise a na-ajụ ụmụ Naịjirịa ajụjụ gbasara etu ngalaba dị icheiche na Naịjirịa si eme kepukepu a na-anụ na-ekwu na a ga-edebanye otu ahụ dịka pati ndọrọndọrọ ọchịchị mana onye na-arụ n'ọba akwụkwọ Olusegun Obasanjo bụ Ayodele Aderinwale kwuru na otu ahụ abụghị otu pati mana ọ bụ otu na-etinye uchu ime ka Naịjirịa dị mma. Ọbụghikwa naanị Obasanjo bụ onye gwuzobe otu ọhụrụ. Ndị ọzọ bụ otu nke akpọrọ Coalition of New Nigeria nakwa otu ọzọ akaghị gwuzobe nke ọma bụ Nigerian Third Force. Otu ndị egwuzobere ọhụrụ maka ntuliaka 2019 i. Olagunsoye Oyinlola - aka chịburu steeti Osun i. Alhaji Abdulsalam i. Donald Duke - aka chịburu steeti Cross River ii. Charles Soludo - onye buburu onyeisi ụlọakụ ukwu CBN iii. Olisa Agbakoba - Onye ọkaiwu a ma ama iv. Tafawa Balewa - aka chịburu Naịjirịa v. Ọkammụta Pat Utomi vi. Oby Ezekwesili - Onye bubu Mịnịsta agụmakwụkwọ na onye kpokobara otu #BringBackOurGirls vii. Frank Nweke Jr - onye buburu Mịnịsịta ọrụ mgbasa ozi wdgz... Ndị ọnụ na-eru n'ọkwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ekwuola na mkpokoba ndị a na-egosi na ntuliaka 2019 ga-esi ike. N'okwu Chukwunonye Okereke, ""Ntuliaka 2019 ga-adị kpọkpọnki. Ọ ga-esikwa ike mana ka a na-ele anya etu ọ ga-adị. ""Ogosila na ọ bụrụ na otu APC ebe ha jibu dịbu iri, ebe ha jizi ugbua ebelatala ihe dịka ebe anọ maọbụ ise."" Chukwunonye gwara BBC Igbo na mkpokoba otu ọhụrụ a bụ iji gwa onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na ọnaghị achị nke ọma. Otu dị icheiche na-apụta bụ maka ntuliaka 2019 Obasanjo na-ebido otu ahụ n'Abeokuta taa dịka ha na akpọku ndị Naịjirịa ka ha zonye n'otu ahụ. Otu ahụ amalitela mgbasa ozi gbasara ha na Twita dịka ha dere na otu ahụ na-ele any ikwalite ma wulie Naịjirịa n'akụkụ niile." afirika-44478707,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44478707,Kedụ ihe mere ndi mmadu adịghị acho inye ọbara na Naịjirịa?,"Kwaa afọ, otu ahụike mbaụwa bụ WHO na-eme mmemme icheta ndị na-eji onwe ha enye ọbara e ji azọ ndị mmadụ ndụ.","Ha wepụtara taa ime ya bụ mmemme n'ụwa niile gbaa gburugburu. Ọ bụrụ na ihe mberede siri ike mee, gọọmenti na-adị akpọ oku ka ndị mmadụ gaa n'ụlọọgwụ nyee ọbara iji zọọ ndụ ndị nọ n'ahụhụ. Otu onye na-enye ọbara BBC Igbo gwara okwu bụ Ezinne Aninwe kwuru na ya na-enye ọbara maka na o nwere mgbe nne ya na nna ya chọrọ ọbara n'ụlọọgwụ oge ahụ esighi ha ike. N'okwu ya; ""Nne na nna m nwere oge ha chọrọ ọbara oge ha dị ndụ, ya mere m ji chee na ọ ga-enye aka ime ka ọbara na-eru ndị ọrịa chọrọ ya aka ọsịsọ. ""Inye ọbara n'aka ndị NBTS ebe anaghị akwụ ụgwọ nakwa eme ọ dị ọnụala igote n'ọnụ ego puku naịra abụọ karịa puku naịra 10 gbagowe a na-ere ya ebe ndị ọzọ."" Inye ọbara na-eme ka ọ na-eru ndị chọrọ ya aka ọsịsọ Otu onye ọzọ anyị gwara okwu bụ Chinonso Ugwungene kwuru na ya anaghị enye ọbara maka na ya enweghi nnukwu nke inye mmadụ. N'okwu ya: ""E chere m na ndị na-enye ọbara bụ ndị nke ha karịrị akarị, echeghi m na m nwere nnukwu inye mmadụ."" N'akụkụ nke ya, Doris Ezeh kwuru na inye ọbara di mma, maka izoputa ndu ndi no na mkpa obara. ""M chọọ inye ọbara, ana m aga n'ulọọru ndị gọọmentị n'ihi na achọghị m ka ọbara m baa n'aka ndị ekperima. Ọzọkwa bụ ka ndị nọ n'ọrụ ahụike leleere m ọbara m nke oma, hụ na etoruru m inye ọbara, ya na odighi nje ọbụla dịkwa n'ọbara m. Agaghị m enye obara ma ọbụrụ na m di ime, enye nwa ara maọbu arịa ọrịa."" Onye ọrụ ahụike BBC Igbo gbara ajụjụọnụ bụ Ọzọrọ Dọkịnta McGinger Ibeneme kwuru na inye ọbara ka bụkwa nnukwu nsogbu ebe ụmụ Naịjirịa nọ. Ọ gụpụtara ụfọdụ ihe na-ajụ na ndị mmadụ anaghị enye ọbara. Ihe na-eme ndị mmadụ anaghị enye ọbara Ụfọdụ ndị na-enye ọbara na-ere ya ere ebe ụfọdụ na-enye ya n'efu Dọkịnta Ibeneme kpọkukwara ndị mmadụ atụmadụ ndị nwere ọbara dị ụkọ dịka ọbara (B negative, O negative na AB negative). Ọzọr Ibeneme kwukwara mkpa ọ dị na gọọmentị na-eme mgbasaozi iji kwalite mmụọ ndị mmaọ̄ụ n'uru ọ dị inye ọbara nakwa ikele ndị na-enye enye. McGinger Ibeneme Uru inye ọbara bara Ọ dịghị mma ọbara ịkarị mmadụ n'ahụ maka na ọ na-ebukwa nsogbu nke ya dịka ike ọgwụgwụ. Inye ọbara nwekwara uru ndị ọbara, dịka ndị Paras Global Hospital si kwuo, nke abụ uru dị n'inye ọbara: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 47565512,https://www.bbc.com/igbo/47565512,"Barcelona Vs Lyon: Messi edulaala Lyon mmụọ, Liverpool kpọọ Bayern ntu n'isi","Leo Messi gosiri ihe o ji bụrụ ""a takata a gbọọ"" n'ihe gbasara ihe e ji ụkwụ eme n'egwuregwu bọọlụ, ma nye goolu abụọ so n'ime ise nyere Barcelona mmeri.","O bu ụzọ nye penariti n'ime nkeji 18 e ji bido bọọlụ, tupu Philippe Coutinho enye ọzọ na nkeji 31. Lucas Tousart nke Lyon bịara gbakpuo otu goolu n'ime nkeji 58, nye ndị na-akwado ha olileanya, mana ọ maghị na ọ bụ ebu ka o ji isi kote. Ebu gbara Lyon makana goolu ahụ meghere ụzọ iwe Barcelona, ha ji were goolu atọ Messi (nkeji 78), Gerard Pique (nkeji 81) na Ousman Dembele (nkeji 86) nyere, ji sụọ ha akwụ. Cheta na enweghị onye nyere goolu ka otu abụọ a zutere n'izu gara aga. Chineke bọọlụ zọrọ Liverpool Rafinha nke Bayern Muenchen ji Sadio Mane nke Liverpool n'ọrụ Otu abụọ a akpaghị ike ka ha zutere n'ụkwụ nke abụọ a, ha gbara bọọlụ ka mmanya ngwọ a kụrụ mmiri. Mana goolu abụọ Sadio Mane nyere na nkeji 26 na 84, mere ka Liverpool zọta isi onwe ha ma nweta ohere isonye n'otu asatọ ga-azọ agba anọ-ikpeazụ. Joel Matip ji aka ya kwaba bọọlụ na neetị ha na nkeji 39, ebe Virgil Van Dijk nyekwara goolu na nkeji 69. Andrew Robertson nke Liverpool nwetara akwụkwọ mme mme, nke ga-egbochi ya isonye ndị otu ya gbaa bọọlụ mbụ ha ga-agba n'agba anọ-ikpeazụ. Mmeri Liverpool pụtara na otu anọ si Premier League (Man City, Tottenham, Liverpool, Man Utd) ga-agafe agba a; nke bụ mbụ ọ na-eme kemgbe afọ 2009. Cheta na a ga-ahọpụta onye ga-ezute ibe n'agba anọ-ikpeazụ, n'ụbọchị Fraịde bụ Maachị 15. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44105471,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44105471,Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe,Gọvanọ na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom ekwuola na ihe o jiri gbaa ndị otu ọchịehi bụ Miyetti Allah akwụkwọ bụ iji nweta ikpe nkwụmọto n'okwu gbasara mwakpo ndị ọchịehi merela na steeti ahụ.,"Samuel Ortom: Otu Miyetti Allah bụ ndịkpatara oke ogbugbu mmadụ na Benue Benue steeti gbara otu Miyetti Allah akwụkwọ n'ụlọikpe nke ga-ebido n' ụbọchị Tọọsde, n'ụlọikpe ugwu dị na Markudi. Ortom kwuru na agbagnyeghị mkpu ọchịchị ya na-eti n'ihe gbasara mkpamkpa na akpa na steeti ahụ, o nwebeghị ihe gọọmentị mere maka nsogbu gbasara ogbugbu mmadụ ndị ọchiehi merela na steeti ahụ. "" Ihe anyị kpebiri ime n'ihi na o nwebeghị ihe gọọmenti mere bụ ịgba otu ahụ akwụkwọ n'ụlọ ikpe. "" A gwala m n'ikpe ahụ ga-amalite na ụlọikpe ukwu dị na Makurdi. ""Anyị ga-eji mmadụ iri asaa na atọ mwakpo mere ụbọchị Afọ Ọhụrụ bido. Ekwenyere m na ụlọikpe ga-enye anyị ikpe nkwụmọọtọ."" N'akụkọ nke ụlọọrụ akụkọ Sun depụtara, Ortom kwuru na "" Ihe gbarasara Miyetti Allah anaghị enye m ọnụ okwu.. Ekwuola m ya ugboro ugboro. I dela m ya, Aga m aga n'ihu na ide ya ma na-eti mkpu maka ndị ndu Miyetti Allah bụ ndị nyụrụ ihe na-esi dịka ọ siri gbasaa oke ogbugbu mmadụ na Benue steeti. ""E nwere ihe mgbaama; ndị dị na igwe mmitaokwu(tapes); ha kpọrọ ọgbakọ ndị ntaakụkọ ebe o nweghị otu onye n'ime ha gọrọ na ihe a sị na ha kwụrụ n'akwụkwọ akụkọ abụghị ihe ha kwuru. ""Ha kwuru na ọ bụ maka Jihadị; ọ bụghị maka ehi ịkpa nri. Ha sị na ọ bụ ịbia were ọnọdụ, ịbia weghara ala. Ekpesarala m ndị ọrụ nchekwa. Enwekwara m olileanya na ha na-elebanye ya bụ okwu anya. ""Mgbe oge ruru, a ga-anwụchi ndị a niile n'ihi na o nweghị onye ga-ala n'efu."" Akụkọ ga-amasị gị:" media-51222237,https://www.bbc.com/igbo/media-51222237,Emume ọkazị Emii: Ihe mere obodo a jiri akwanyere akwụkwọ nrị a ugwu,"Ọkazi bụ akwụkwọ nrị eji ete ofe, ma jikwara ya agwọ ngwọ ngwọ na ihe ndị ọzọ.","Obodo Emii dị n'Imo steeeti nwere oriri ha na-eri maka ọkazị. Ka ha siri kụọ akụkọ ya, ha si na ọ bu nna mụrụ ha aha ya bụ Emii choputara akwụkwọ nrị a ma rie ya hu na ọ dị ya mma na-ahụ. N'oge emume ọkazị a, ndị Emii adịghị ese okwu maọbu lụọ ọgu. Ha sị na oge emume a, onye ọbụla nwereike ga rie nri ebe ọbụla ọ chọrọ. Ọzọkwa bu na ọ bụ naanị ọkazi ka a na-esi n'obodo ahu n'oge emume ọkazị." egwuregwu-44484302,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44484302,World Cup 2018: Ihe niile i kwesiri ịma n'ụzọ asaa,Ọ bụ eziokwu na ndị Jaminị mara agba penaliti? Kedụ mkpa ọ dị ịbụ na be ụnụ ka a nọ n'asọmpi? Nakwa kedụ onye Meziko na-egbochi goolu nyerela goolu n'iko mba ụwa dịka Cristiano Ronaldo?,"Dịka iko mba ụwa na-enwuru ọkụ, anyị ga-azaa ajụjụ ndị a na ndị ọzọ. 1. Kedụ ndị kacha merie n'iko mbaụwa? Brazil bụ ọkaibe ma e kwuwe okwu mmeri n'iko mbaụwa dịka ha meriela ugboro ise. mmeri ikpeazụ ha bụ n'afọ 2002. A gbara na be ha n'afọ 2014, mana ha biri ka onye ụmengwụ na ọkara ikpeazụ (semi-final) ebe e nyere ha ọkụ asaa a satara otu (7-1) O nwebeghị mba anọghị na Yuropu ma ọ bụ Saụt-Amerika bulierela iko mbaụwa, ebe mmeri nke Jaminị, Spen, na Ịtali n'asompi atọ e mere n'ikpeazụ a na-egosi na Yuropu bu ụzọ site na mmeri iri na otu, ebe Saụt Amerịka nwerela itoolu. 2. Kedụ onye kachasị nye goolu? Nwaafọ Jamini ọkpa na-aghọ nkọ n'inye goal bụ Miroslav Klose bụ onye kachasịrị nye goolu site na-inye goolu iri na isii n'asompi iko mbaụwa anọ. Ọ lara ezumike nka n'afọ 2016 mana ọ ga-aga Roshia dịka otu n'ime ndị ọrụ nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ ala ya. Nwaafọ Brazil bụ Ronaldo bụ onye nke abụọ site na inye goolu iri na ise, asatọ n'ime so na mmeri nke mba ahụ meriri n'afọ 2002. Nwa amala Fransị bụ Just Fontaine bụ onye kachasị nye gọolu n'otu asompi. O nyere goolu iri na atọ n'egwuregwu isii n'asompi afọ 1958. 3. Kedụ maka ndị egwuregwu ugbua? N'ime ndị egwuregwu ndị nyerela goolu iri maọbụ karia na iko mbaụwa, naanị nwaafọ Jaminị na-agba n'etiti bụ Thomas Muller ga-eso aga Rọshịa dịka onye egwuregwu. Iji sonyere nwa amala ya bụ Klose onye nke nọ ọkwa mbụ, Muller ga-agba mbọ inwetakarịa goolu ise o nyerela n'otu asompi. Nwafọ Kolombia bụ James Rodriguez ritere nzere akpụkpọụkwụ ọlaedo ('Golden Boot') oge ọ ggbara n'ikpeazụ a, nye mere o mee ka o mere na mbụ, ọ ga e soro ndị bụ ọkaibe. Naanị otu onye ogbo goolu (defender) sonyerenụ bụ Rafael Marquez gbara afọ 39, onye ga-abụ nke ise ọ na-agbara mba Meziko iko mbaụwa nyereluola goolu dịka Cristiano Ronaldo. 4. Otu egwuregwu anaghị enyezi goolu ka ha si enyebu Goolu ole enyere n'egwuregwu agbara n'iko mbaụwa ikpeazụ bụ nke pekarisiri na ndị niile a gbara kemgbe afọ 1966 - afọ mbụ ndị ọkacharamara n'okwu bọọlụ bụ Opta bidoro nwewa ndekọ maka nke a. Agbanyeghị nke a, ihe dịka goal abụọ na ọkara bụ ihe e nyere n'egwuregwu ọbụla a gbara n'afọ 2014 bụ nke kachasị kemgbe asompi iko mbaụwa e mere na mba Spen n'afọ 1882. Ọ dịka goolu a na-enye site n'akụkụ agbadala. Ezigbo ọmụmaatụ bụ iji iko mbaụwa a gbara ikpeazụ tụnyere nke mbụ Opta dekọrọ nke Ingland meriri na afọ 1966. Na mgbacha asompi afọ 1966, e nwere bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ si etiti ọgbọ bọọlụ (outside the box) gbaa karịrị nke sị n'ọnụ igwe goolu, mana n'ime bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ iri abụọ a gbara n'afọ asompi ikpeazụ nke afọ 2014, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e siri na ebe penaliti were gbaa. 5. Ingland nwere ike ịna asọ gani gani mana Premia Lig ka chị ọgbọ Kemgbe mmeri ha nwere n'afọ 1966, Ingland agabeghị karịa agba nke anọ otu ugboro. Mana nke a akwụsịghị mba ndị iji ụmụafọ ha na-agba bọọlụ na otu egwuregwu na-agba n' Premia Lig. Na agbanyeghị ndị kara aka n'a bọọlụ dịka Leroy Sane, Marcos Alonso na David Luiz hapụrụ ụlọ, Premia Lig nwetara ndị egwuregwu karia ndị ọzọ. E nwere ndị egwuregwu 130 so na iko mbaụwa aha ha dị na klọb ndị so na lig atọ kachasị n'Ingland oge a kpọpụtara ndị ga-esonye, iji tụnyere 81 si mba Spen nakwa 67 si Jamanị. Uregwayị, Panama, Sawudi Arebia na Rọshịa bụ naanị mba akpọghị ndị ọgba bọọlụ mba ha nọ Ingland. Ingland bụkwa naani otu mba ebe mmadụ 23 na-agbara ha bọọlụ si n'otu otu egwuregwu. n'aka nke ọzọ, Swidịn na Senegal bụ - naanị mba abụọ enweghị ndị na-agbara ha bọọlụ bụ ndị si na otu egwuregwu ndị ụlọ ha (local league). 6. Kedụ ka ndị otu egwuregwu ndị na nọ be ha si mee? O nweghị onye nọ na Brazil a ga-echetara na ha bụ ndị e hiwere iko mba ụwa ugboro abụọ na be ha. Ndị obere agbata bi ha bụ Uregwayị ịgbagbu ha nara ha iko n'afọ 1950 nakwa Jaminị iji ọkpụ goolu asaa asatara otu gbagbu ha n'afọ 2014 bụ nnukwu ihe ihere nyere mba ha. Mana ọtụtụ mba na-emekarị ọfụma karịa ma ha nwee nkwwadọ ụlọ. Rọshịa na-enwe olileanya na ha ga-eso ụtọukwu a nakwa na ha ga apụta n'otu ha nakwa nke Uregwayị, Ijipt na Saụdị Arebia. Ọ bụrụ na ha mee otu a, Saụt Afrika ga abụ naanị otu mba e hiwere iko mba ụwa n'be ha agbapụrụ n'agba nke mbụ. 7. Ịgba Penaliti O nweghị akụkọ iko mbaụwa n'ezu oke ma o bighị na penaliti. Naanị otu onye Jamanị bụ onye agbataghị ya n'iko mba ụwa, ebe ha gbatachara penaliti anọ ha gbarala. Kemgbe ha nwetachara 15 n'otu ọgbara kemgbe afọ 1982. Ọgbagwojughị onye ọbụla anya na Ingland bụ otu egwuregwu kacha njọ na iịgba penaliti, dịka ha gbara aka na penaliti atọ ha gbarala, na emerighị nke ọbụla. A kpụkwara Italị n'ụzọ gbawara obi ugboro atọ nke gụnyere mgbasa asọmpi 1994 oge ọgba bọọlụ pụrụiche bụ Roberto Baggio gbafere ball n'elu igwe goolu. Mana mmeri ha n'asọmpi 2006 ebe ha meriri mba Fransi tidara obi otutu ndị Itali ndị obi adịghị mma maka usoro boolu a. Ndị mere eserese a bụ Joy Roxas na Sandra Rodriguez Chillida Usoro nhazi Maka ihe gosiri 'otu egwuregwu a nọ be ha agba' na-enwekarị ""pọints"" ngụkọ anyị nwetara site na Fifa na-agụ pụtara dịka onyelaba onyelaba ma ọ bụru na e jiri penaliti kpebia onye meriri n'agba mgbapụ nakwa dịka mmeri maọbụ mgbagbu ma ọ bụrụ na mpụtara mee na mmezi oge (extra time). Maka ihe gosiri 'ndị nka bọọlụ toro n'ụlọ' anyị tinyere mba iri na otu nwekachasị ndị egwuregwu na-agbara ha n'ala ha. Otu klọb ndị egwuregwu sonyere sị n'akwụkwọ nke Fifa wepụtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-57056132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-57056132,Unknown Gunmen: Etu e si gbuo otu nwaanyị na ndị ọzọ n'Ozubulu,Ndị ji egbe awakpoola ụlọọrụ ndị nche ma gbuo ihe a na-eche ruru mmadụ ise na mpaghara Ozubulu dị n'Anambara steeti.,Ikenga Tochukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ndị omekome a mụnyekwara ma ụlọọrụ ma ụgbọala ndị nọ ebe ahụ ọkụ. Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ụlọ ndị nche a gbara ọkụ nakwa ngwa obibi akpọrọ ọkụ n'obodo ahụ. Onye hụrụ ebe ihe mere na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ hụrụ ozu otu nwaanyị nakwa ụmụnwoke atọ n'ebe ahụ. Onyeisi ndị nchekwa obodo bụ Jude Ononuju gwara BBC Igbo na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụ na ya bụ ihe. O kwuru na ndị ahụ gụnyere otu nwaanyị nakwa nwoke abụọ ha bụ ndị nchekwa obodo na-ekpe ikpe tupu awakpoo ha. E chere na a wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii n'Ozubulu dị nso n'ebe ahụ. afirika-46556465,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46556465,'Ịkpa isi ka m ji enyere ụmụ nne m na ezinaụlọ m aka',Akaọrụ bụ otu ihe dị mkpa mmadụ inwe n'obodo iji kwado onwe ya ma nyekwara onwe ya aka.,"Ụfọdụ aka ọrụ ka e ji mara ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na mbụ mana ugbua, ọtụtụ ụmụnwoke na-emezi ihe ụmụnwaanyị na-eme dịka ịkpa isi, isi nri wdgz. Kingsley Isaac nke e ji 'HairbyKings' were mara bụ otu onye banyere n'akaọrụ ụmụnwaanyị nke bụ ịkpa isi ma jiri ya na-emepụta ihe dị icheiche. Agbanyeghị na ọ na-eme ya n'ụdị pụrụ iche, Kingsley kọwara na ya ejirila akaọrụ ahụ zụpụta onwe ya n'agba mahadum nke mbụ ma na-agakwa nke abụọ. Nke a gụpụghị enyemaka ọ na-enyere ezinaụlọ ya. Akaọrụ Kingsley na-atụ n'anya, lee ihe ọ na-emepụta n'onyonyo a: Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-43851453,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43851453,Okporo mmanụ agbawala n'Ipaja nke Legọs,"Otu okporo mmanụ dị na ogige Peace Estate nke Baruwa dị n'Ipaja Legọs Steeti, a na-eche na ọ bụ ndị mmadụ kụwara, agbawala ma baa ọkụ.","Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs Steeti bụ Chike Oti gwara BBC Pidgin na nke abụ eziokwu. O kwuru na site na nyocha ha mere, a na-eche na ọ bụ otu onye ji ọkụ gaa n'ime ọhịa ebe okporo mmanụ NNPC na-ehifu ehifu butere ọkụ mgbawa ahụ. Oti kwuru na okporo mmanụ a na-ehifu ehifu kamgbe , nke bụtere mmetọ na mmerụ mmiri dị na gburugburu ebe ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: O kwuru na ha anụbeghị maka onye nwụrụ ma ọ bụ merụrụ ahụ na mgbawa okporo mmanụ ahụ, ebe nyocha ka na-aga n'ihu. BBC gbara mbọ inweta ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ bụ Fire Service n'olu bekee ma na ha enweghị azịza gbasara ya. Mana ndị mmadụ bị gburugburu ebe ahụ kọwara okporo mmanụ gbawara n'ezie, dịka ọtụ onye dere ya n'akara tuwitta." egwuregwu-47969599,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-47969599,BBC Nwaanyị kachasị agba bọọlụ n'afọ 2019 - Họpụta onye masịrị gị,E wepụtala aha ndị na-azọ BBC Nwaanyị Kachasị Agba Bọọlụ nke afọ 2019 - enwereike ịhọpụta onye masịrị gị.,"Nwafọ mba Ịngland bụ Lucy Bronze ji ọkwa ugbua. Mmadụ ise na-azọ ọkwa a nke BBC World Service na-ahazi bụ ndị ọkachamara gụnyere ndị nchịkọta egwuregwu bọọlụ, ndị ọgba bọọlụ, ndị nhazi nakwa ndị ntaakụkọ bọọlụ. Ndị ahọpụtara gụnyere: Ohere ibinyeaka ga-emechi na Tọzde, 2 Mee n'elekere asatọ nke ụtụtụ, a ga-akpọpụta onye meriri na Wenezde, 22 Mee na websaịt BBC World Service nakwa BBC Sports. I nwere ike Pịa aka ebe a ka ibinyeaka. Nke a bụ ihe ikwesiri ịma maka mmadụ ise na-azọkwa a nke nọ n'afọ ise ya. Pernille Harder Afọ ole: 26 Mba: Denmark Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 110 Otu egwuregwu: VFL Wolfsburg Ọnọdụ: Ebe ihu Harder gbachara asọmpi afọ 2017-18 ebe o ji goolu 17 bụrụ onye kachasị enye goolu na Bundesliga nke ụmụnwaanyị ma nyere Wolfsburg ịmabute ike ugboro abụọ kpakọrọ ọnụ. Ọ gbara ma nye goolu n'asọmpi ikpeazụ nke Champịọns League afọ gara aga megide Olympique Lyonnais, mana ọ mabuteghi iko a mgbe eji ọkpụ anọ asatara otu merie ha. Agbanyeghi nke a, Harder turuugbo nke onwe ya dịka nwaanyị kachasị agba bọọlụ nke Uefa afọ 2018. Ọ bụkwa osote onye turuugo Ballon d'Or nke ụmụnwaanyị. Ada Hegerberg Afọ ole: 23 Mba: Norway Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 66 Otu egwuregwu: Olympique Lyonnais Ọnọdụ: Ebe ihu Hergerberg mabutere iko Champions League nke ugboro ato kpokotara onu n'aha Olympique Lyonnais n'afo gara aga ma nyekwa goolu 15 n'asompi ahu dike otu egwu ya chi mmeri aka abuo na Spen nakwa Europe. Hegerberg enyela goolu 193 kemgbe o banyere otu egwu ya n'afo 2014. O nyere goolu 19 na mbata ya n'asompi 18 n'afo a.O tinyere aka n'akwukwu ga-aghati oge ya n'otu ahu na Sọma gara aga.Nwafo Norway na anaghi agbaziri Norwaybboolu bu nwaanyi mbu turuugo Ballon d'Or n'afo 2018. Lindsey Horan Afọ ole: 24 Mba: USA Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 62 Na Seputemba afo 2018, Horan turu ugo nwaanyi kachasi ada ọnụ ahịa na National Women's Soccer League (NWSL). O wee buru onye otu egwu Portland Thorns mbụ nwetara nturuugo a mgbe o nyere goolu 13 na ententes aka inwete goolu abuo n'ime asọmpị 22 n'afọ a. Horan nyere otu egwu ya aka iru agba ikpeazu asọmpi NWSL ebe ha gbara ndi nke abụọ n'ihi mmeri otu North Carolina Courage meriri ha. Sam Kerr Afọ ole: 25 Mba: Australia Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 67 Kerr onye na-agbara ndi Perth Glory na Chicago Red Stars boolu ugbua bu okachasi enye goolu n'asompi NWSL, o nyetekwara ogogo a n'asompi W League nke Australia n'onwa Jenuwari afo 2019.O ritere buutu olaedo nke ugboro abuo kpokoro onu n'afo 2018 dika o nyere goolu 16 na enyemaka 19 n'otu egwu Red Stars.Emere Kerr onye ndu otu egwu mba Australia n'onwa Febuwari, o duru ha imabute iko mba ndi Australia ha nke mbu. Saki Kumagai Afọ Ole: 28 Mba: Japan Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 102 Kumagai, onye mabuterela Iko Mbauwa du ndi otu egwu mba Japan n'asọmpi Asian Cup n'afọ 2018 bu nke mabutere na mbụ n'ime afo ano. O so na ndi otu egwu Olympique Lyonnais mabutere iko abụọ n'afo 2017-18. O mabutela Iko Champions League ugboro atọ. Kumagai gbaliri ike ya ịhụ na otu egwu mba Fransi a bụ ndi na-eke nkwụcha nke oma, nke mere e ji nye ha naani goolu isii n'asọmpi 20." afirika-56061614,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56061614,Pregnancy Complications: Ọrịa 8 ụmụnwaanyị dị ime na-arịa karị,Afọ ime bụ ezigbo ihe mana ọ dịmma ka ndị mmadụ mata ụfọdụ ihe mgbu na-eso ya ka ha wee gbochinwuo ya maọbụ gwọta ya.,"Dịka dọkịta Joseph Ayinde na-ahụ maka ahụ ụmụnwaanyị si kwu, ọrịa afọ ime ndị a abụghị ụmụ nwaanyị niile ka o na-eme makana ahụ dị n'iche iche. Etu ụmụ nwaanyị dị iche cihe siri kọwaa etu ime nwa ha sịrị pụọ iche Dọkịta Akinde kọpụtara ọrịa ndị a dịka ndị na-emekarị ụmụ nwaanyị dị ime. Malaria bụ ọrịa kacha enye ụmụnwaanyị dị ime nsogbu tụmadụ ọnwa atọ ha ji tụrụcha ime ọhụrụ dịka dọkịta Ayinde si kwu. Oke anwụnta , gburugburu ruru unyi nakwa mmiri dọtị dọkọ n'otu ebe na-ebute ọrịa a. Ogbugbo: Rahụ na neti ga-ekpuchi gị na afọ ime ọfụma ka anwụ nta ghara ịta gị. Gakwuru dọkita gị ka o nye gị ọgwụ mgbochi iba ka afọ ime gị na-erute ọnwa anọ na ọnwa ise. Anaemia bụkwa ọrịa ọzọ na-emekarị ụnwaanyị dị ime. Nke a pụtara mgbatụ ọbara dị n'ahụ nwaanyị bu afọ ime makana ahụ nwaanyị chọkwurụ ọbara o ji arụ arụ maka ibu ọzọ o bu. Ogbugbo: Rie nri ọfụma, ma nwuo ọgwụ iron nakwa Folic acid ọfụma dọkịta gị nyere gị. Ọbara mgbanielu: Dọkịta Akinde kwuru na ọrịa a na-ebute ihe bekee kpọrọ 'hypertension', na-emekarị ụmụnwaanyị dị ime makana ọ bụghị naanị ahụ ha na-anata ndozi, ha na nwa ha bu n'afọ na-eke ya. O kwuru na ọbara mbanielu na-emekarị nwaanyị gbagoterela n'ọnụọgụ afọ iri atọ na isii, mere na ọ ji arịọ ka ụmụnwaanyị mụchaa nwa ha ka ha dị afọ na-erubeghị 35-40. Ọgbugbo: Na-enyocha onwe gị ka ịwee mara mgbe ọbara gị ji gbalie elu ka ị wee bido n'oge gwọwa ya. Naanị ndị nwere ya ga-aga nata ọgwụgwọ n'aka dọkịta, ọ bụghị nwaanyị niile bụ afọ ime ka nke a na-eme. Gestational Diabetes: Aha ọzọ a na-akpọkwa nke a bụ ọrịa suga. Dọkịta Akinde kwuru na afọ ime nwerike ịkpalite ọrịa suga n'ahụ nwaanyị dị ime maọbụ ọ bụrụ na nwaanyị ahụ si n'aka nne na nna ya nwete ya bụ ọrịa. Ndị dọkita na-achọpụtakarị ọrịa a n'ahụ nwaanyị dị ime bido izụ ụka iri abụọ na anọ ruo nke iri abụọ na asatọ nwaanyị ahụ ji dị ime. Dịka ụlọgwụ Cleveland dị na mba Amerịka si depụta na website ha, GD anaghị ebu ihe ngosi ọbụla mana ụfọdụ ụmụnwaanyị dị ime nwerike inwe ihe ngosi dịka oke ịnyụ mamiri, oke igbọ agbọ, oke agụ ịnụ mmiri na oke ike ọgwụgwụ. Ogbugbo: Ị ga na-ga ahụ dọkịta gị kwa mgbe mgbe dịka afọ ime ka na-aga n'ihu, dọkita gị ga-ele ele ogo sụga dị n'ahụ mgbe ọbụla, ị ga e jikwa igwe e ji elele ogo sụga na-enyokwa ya n'aka gị n'ụlọ gị. Ụfọdụ ụmụnwaanyị nwerike ị chọ ọgwụ maka ibelata ọrịa a mana ụfọdụ bụ naanị nri nakwa ndọtị ahụ ka ha ga-eji belata sụga dị ha n'ahụ. Etu ụmụ nwaanyị dị iche cihe siri kọwaa etu ime nwa ha sịrị pụọ iche Sickle Cell disorder: Dọkịta Ayinde kwuru na ọrịa sickle cell na-enye ụfọdụ ụmụnwaanyị dị ime nsogbu. Ogbugbo: Nwaanyị dị ime bu udiri ọrịa a ga ana-anwụ folic acid ọfụma. Nwoke ahụ na-enye ụmụ nwaanyị ọgwụ na-eko ha afọ Ọrịa obi: Ụmụnwaanyị dị ime na-arịakarị ọrịa obi dị iche iche. Ayinde kwuru na ụfọdụ n'ime ụmụnwaanyị dị ime na-enwebụ ya bụ ọrịa obi mana afọ ime na-eme ka ọ kawanye njọ. Ogbugbo: Ị ga-anaga ahụ dọkịta gị kwa mgbe kwa mgbe, na-ezu ike ọfụma,gbanahụ oke ibu nakwa oke ndọlị, gwọ ọrịa ọbara mgbatụ ka ị wee gbanahụ ọrịa obi dị iche iche n'afọ ime. Varicose Vein: Ayinde kwuru na ọrịa a naghị enyecha ụmụnwaaanyị dị ime nsogbu. Vein bụ paip na-ebuga ọbara n'ọbị nakwa ụbụrụ n'ahụ mmadụ dịka Ayinde si kọwaa. O kwuru na ọ bụ etu homonu si emetụta ebe ọbara si aga maọbụ etu isi nwa si nyido ụkwụ nne ya nwereike ibute 'Varicose Vein'. O kwuru na ụmnwaanyị dị ime ga-emeli ihe dị na ya n'ụzọ ndị a: Dinara ala ma welite ụkwụ gị elu mgbe ọbụla. Mana ọ ka njọ, ọ dịmma ka nwaanyị ahụ ga-ahụ dọkịta nata ezigbo ọgwụgwụ. Ịbụ asọ, ịgbọ agbọ na ụkwụ zara aza: Ndị a sokwa n'ọrịa ụmụnwaanyị dị ime na-arịakarị mana Ayinde kwuru na ha abuchaghị oke nsogbu nye nwaanyị dị ime. Kama na ọ bụrụ na ọ ka njọ, ọ ga-adị mma ka dọkịta onye ahụ nye ya akwa n'ụlọọgwụ ma leruo ya anya ọfụma. Na nchịkọta , Dọkịta Akinde kwuru na ọ dị mma ka ụmụnwaanyị mụcha nwa n'oge ihe dịka n'afọ iri atọ na ise (35) makana afọ ole nwaanyị dị wee tụrụ ime sokwa eme ka ụfọdụ ọrịa ndị a nye ya oke nsogbu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Chioma Inyang: Ihe mere m ji were ankara kwaara onwe m uwe agbamakwụkwọ" afirika-49909203,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49909203,Drug Trafficking: Ndị 'Customs' ejichiela anwụrụ ike ruru nde kwuru nde naịra si Ghana abata Naịjiria,Ngalaba na-ahụ maka ntụbata ahịa na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Customs Service' ejichiela anwụrụ ike ọnụahịa ya ruru nde kwuru nde naịra.,"Anwụrụ ike ndị 'Customs' jichiri. Zhulkiflu Abdullahi bu onye isi ngalaba 'Customs' na Steeti Oyo na Osun gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchị Wenezde. Abdullahi kwuru na ọ bụ Ghana ka ndị ekperima si buru anwụrụ ike ahụ na-ebubata Naịjiria. N'okwu ya: ""Ndị ekperima a achọghị izu ike, n'agbanyeghi na e mechiela oke ala Naijiria na mba ndị ọzọ."" ""Ya mere, anyi agaghị ezu ike iji hụ na anyị nwụchiri ha niile."" Zhulkiflu Abdullahi kwuru na otu ngwugwu anwụrụ ike ahụ karịrị otu nari puku naịra na puku naịra iri ise. Abdullahi kọwara na ọnụahịa anwụrụ ike ahụ ha jichiri ga-akarị otu narị nde naịra na nde naịra iri isii. Dịka e si kechie anwụrụ ahụ, otu ngwugwu ga-akarị otu nari puku naịra na puku naịra iri ise. Abdullahi kwukwara na ọ bụrụ na anwụrụ ike ahụ bara n'ime obodo, ihe ọ ga-emebi na ndụ ndị ntorobịa buru ibu. O kwuru na ndị ọrụ nchekwa niile amụrụla anya ka azụ iji hụ na ha chekwara Naịjiria nke ọma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi: Ihe nkiri ga-amasị gị: Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?" afirika-45209341,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45209341,Dimkpa ndị na-atụ akpịrị,Ọ bụ eziokwu ama ama na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị Igbo na-agba mbọ pụrụiche n'ime agbụrụ niile dị na Naịjirịa.,"Ọ bụkwa ihe ọzọ ama ama na ha na-ama mma pụrụiche. I jịkọzie ihe abụọ ndị a, gịnị ka ị ga-enweta? Ngwa bịa hụrụ ụmụnwoke ndị Igbo mara mma, na-agba mbọ ụmụnwaanyị na-achọ ka akara ọkụ. Ndị na-eti egwu 1. Patoranking Patrick Nnaemeka Okorie ama dịka 'Patoranking' bụ onye otiegwu ama ama si Ebonyi steeti. Ọ lụbeghị nwaanyị, ọ mụbeghikwanụ nwa ka ụfọdụ ndị ibe ya na-alụbeghị nwaanyị si mee. O nwekwara ego ugbua n'agbanyeghị na ọ tara ezigbo ahụhụ ka ọ na-etolite. Ị hụla ụgbọala ya na etu o si eke ekike? 2. Jidenna Jidenna Theodore Mobisson bụ onye otiegwu si Enugwu steeti. Nna ya lụrụ onyeọcha, a mụọ ya na mba Amerịka. Ọ lụbeghị nwaanyị, mana ọ na-ewuru ọtụtụ ụmụnwaanyị, ọtụtụ bụ ndị ga-achọ ịmụrụ ya nwa n'efu (ị ghọtago?). 3. Lynxx Chuka Edozien a ma dị ka 'Lynxx' bụ onye Delta steeti. Nna ya bụ John Edozien bụbu osote gọvanọ chịrị Bendel bụzi Delta na Edo steeti ugbua. Lynxx na-akụbu egwu ụwa nke Bekee kpọrọ 'secular music', mana o kwuru na o chegharịala na-akụzi egwu na-abụghị maka ịchụ nwaanyị maọbụ imefu ego. Ị hụla ya ebe ọ na-eyighị uwe elu? Ngwa mechie ọnụ gị ghe oghe. 4. Zoro Chimaobi Chrismanther Owoh ji egwu 'Ogene' tibata n'ọgbọ egwu na Naịjirịa niile. A mụrụ ya n'Anambara steeti mana ọ bụ onye Enugwu steeti. Ndị ọgba bọọlụ 5. Alex Iwobi Alexander Chuka Iwobi bụ nwa nwanne ọgba bọọlụ bụ JayJay Okocha. O na-agbara Arsenal bọọlụ. O sokwa Naịjirịa si asọmpị Iko Mbaụwa nke 2018 laghachite. Enweghị ihe ọzọ ụmụnwaanyị ga-achọ n'aka ya, ha ga-achọ ego ya na-anyitu akpa nakwa akwụkwọ ikike njem ya (o nwere nke Briten bụ ebe o toro). 6. Ịheanachọ Kelechi Ịheanachọ so n'otu ndị Naịjirịa gara asọmpị Iko Mbaụwa 2018 na mba Rọshịa. Ọ na-agbara Leicester City ugbua. Ị ma na ọ e tinyere akara aha ya n'uwe o ji agba bọọlụ na Leicester City? Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arọ nrọ ịbụ nwunye ya maka ụdịrị ego ọ na-akpata na bọọlụ. 7. Victor Anichebe Victor Anichebe bụ onye Anambara steeti. Ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ ihe ruru afọ anọ. Ọ gbakwaara Everton nakwa Sunderland FC dị n'England tupu ọ gaa otu Beijin Enterprise dị na China bụ ebe ọ nọ ugbua. Dịka egwu Morocco Maduka gụrụ sị na ""ọgaranya amaka mma n'okorobia' ọ bụghịkwa naanị mma ka ọ mara, o nwekwara ego 'na-esi isi' (ọ bụrụ asị jụọ 'DJ Cuppy' ọ zụnyere ụgbọala G-Wagon oge ha na-ayị). Victor Anichebe yịburu Florence 'DJ Cuppy' Otedola bụ nwa Femi Otedola; otu n'ime ndị kacha nwee ego na Naịjirịa Ndị ome ihe onyonyo 8. Bryan Okwara O meriri asọmpị ịchọpụta nwoke 'kacha mma na Naịjirịa' n'afọ 2007. Ugbua, ọ na-eme ihe onyonyo nakwa onye ngosi akwa bụ 'model' na Bekee. Ị ma ụmụnwaanyị ole na-arọ nrọ ịbụ nwunye ya otu ụbọchị? 9. Chiwetel Ejiofor Onye Enugwu steeti a mụrụ na mba ofesi, Chiwetel Ejiofor pụtara n'ihe onyonyo bụ 'Half of a Yellow Sun' nke e si n'akwụkwọ Chimamanda Ngozi Adichie dere rụpụta. Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arọ nrọ ụbọchị ọ ga-asị ha ""sịịịịị, biko gee m ntị ka m gwa gị"". Ọ bụghị naanị mma ka ọ mara, o nwekwara akwụkwọ ikike njem nke mba Amerịka, ma nwekwaa ego igwe nke Bekee kpọrọ 'hard currency' (ị ghọtago?). 10. Chris Okagbue Chris Okagbue bụ onye ogba-egwu bụrụkwa onye ome ihe onyonyo na Nollywood. O nwere ejima a kpọrọ Cris Okagbue. Nwanne ha nwaanyị bụ Sandra Okagbue, ugegbe oyibo Flavour. Nna ha nwụrụ anwụ bụbu Obi Ọfala Okagbue, bụbu Obi nke Ọnịcha a ma dịka 'Agbọgidi'. Chris bụ ọmụmaatụ 'a hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya.' Akụkọ ga-amasị gị" media-44581470,https://www.bbc.com/igbo/media-44581470,World Cup 2018: Ugo Naịjirịa efeliela ọzọ ka ha sụrụ Aịsland ọkpụ abụọ,Ahmed Musa bụ onye na-agba n'ihu n'ime otu Super Eagles bụ onye nyere ọkpụ goolu abụọ n'ime asọmpi Naijiria na Aịsland.,"Ahmed Musa Super Eagles na Argentina ga-asọ mpi nke ha n'ụbọchị 26 n'ime ọnwa Juun. Asọmpi Naịjirịa na Aisland agwụchaala. Nkeji 93: Mikel Obi emeruola ahụ n'aka. Ha enyela ha oge ruru nkeji isi. Nkeji 89: Alex Iwobi anọchiela anaya Etebo Nkeji 85: Ighalo anọchịela Iheanacho Nkeji 82: Aịsland agbafuola penarita ha. Nkeji 81: Aịsland enweela Penalti Nkeji 74: Goooooolu! Musa enyeela ọkpụ nke abụọ. Ọ bụ Kenneth Omeruo nyere ya aka. Nkeji 70: Super Eagles enweela 'Corner' mana isi Balogun emetụghi na bọọlụ ọfụma. Nkeji 65: Victor Moses na-agba mbọ nke ọma ị nye goolu. Nkeji 63: Francis Uzoho azụọla ndị Super Eagles Nkeji 59: Ndị na-akwado otu aịsland na-akụ aka ịkpalịte ndị otu ha obi. Nkeji 57: Aịsland na-achọ ị zaghachị ndị Super Eagles mana ụzọ adịghị Nkeji 51: Ragnar Sigurdsson onye otu Aịsland emeruola ahụ maka ya na Musa kụkọtara isi. Nkeji 49: Goooooolu!! Ahmed Musa enyeela goolu. Moses bụ onye nyere ya aka. Brian Idowu apụọla, Tyronne Ebuehi bụ onye nọchịrị ya. Agba nke abụọ ebidola Enweela ezumike nkeji iri na ise Nkeji 45: Enyekwala ha oge ruo nkeji abụọ. Nkeji 43: Enyeela Bryan Idowu akwụkwọ ịdọ aka na ntị. Nkeji 42: Super Eagles enweela 'corner' ọzọ mana agbafuru ya. Njkeji 40: Musa enweela off-side. Nkeji 36: Naịjịrịa enweela 'Free kick' mana agbafuola ya. Nkeji 34: Victor Moses adaala ka o si ada. Nkeji 32: Aịsland agbafuola 'free kick' ha. Nkeji 26: Ọ bụ zị ndị Super Eagles na-agba sị ha ike. Nkeji 24: Omeruo azọọla ndị Super Eagles. Nkeji 22: Aịsland na-akwanya ọkụ n'ike ndị Super Eagles Nkeji 20: Gylfi Sigurdsson onye otu Aịsland na-agba nke ọma mana ndị nche Super Eagles chebidoro ya. Nkeji 15: Ndị Aịsland ka na-agba mbọ ị bata n'ụlọ Super Eagles mana ọ na-afịa ha ahụ. Nkeji 13: Super Eagles enweela 'throw in' Nkeji 11: Ndị Super Eagles ka na-agba mbọ ị banyere n'ime ụlọ ndị Aịsland mana ụzọ adịbe ugbua. Nkeji 9: Ndị otu Naịjirịa na-agbasị ike ugbua mana ndị Aịsland chebidoro ha ebe niile. Nkeji 7: Iheanacho agbaala 'corner' mana ọ banyeghị goolu. Otu Nkeji: Ebidola bọọlụ n'ọgbọ egwuregwu Volgograd. Ndị Aịsland bidoro bọọlụ: Hannes Thor Halldorsson; Hordur Bjorgvin Magnusson, Ragnar Sigurdsson, Kari Arnason, Birkir Mar Saevarsson; Birkir Bjarnason, Aron Gunnarsson, Gylfi Sigurdsson, Rurik Gislason; Jon Dadi Bodvarsson, Alfred Finnbogason. Naịjirịa kwesiri ịgba mbọ merie n'asọmpị a ma ọbụrụ na ha ga-aga n'ihu n'Iko Mbaụwa. Ndị Naịjirịa bidoro bọọlụ: Francis Uzoho, Kenneth Omeruo, William Troost-Ekong, Leon Balogun; Brian Idowu, Oghenekaro Etebo, John Obi Mikel, Wilfred Ndidi, Victor Moses, Ahmed Musa, Kelechi Iheanacho. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-47392135,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47392135,Election result 2019: 'Buhari gbanwee ndị na-arụrụ gị ọrụ',"Ka e mechara ntuliaka họpụtara Muhammadu Buhari ịchị Naịjirịa ọzọ, ndị mmadụ ekwuola ihe ha chọrọ n'aka ya.","Ihe ndị mmadụ kwuru maka mmeri Buhari Ebe ụfọdụ na-achọ ka ọ gbanwee etu o si achịbu n'agba nke mbụ, ndị ọzọ na-achọ ka o webata ihe ọhụrụ n'usoro ọchịchị ya. Dịka ndị mmadụ gwara BBC Igbo ihe ha chọrọ n'aka Onyeisala Buhari n'ihe nkiri dị n'ime akụkọ a, ndị mmadụ kwulitekwara okwu ihe ha chọrọ na soshal midia. Ha ji ihe ha kpọrọ ""#Buharishould"" nke pati APC kpalitere, wee na-ekwuputa uche obi ha ma mee ka o wuo ewuo ka ndị nọ n'ọchịchị nwee ike hụ ya mara ihe ha ga-eme maka ya. Ihe ha chọrọ: @olusegunthomas2 chọrọ ka Buhari mee ihe maka ọnọdụ ọkụ latrik na etu ndị mmadụ si akwụ ụgwọ ọkụ ha ejighi mee ihe ọbụla. @Ebuka na-ajụ ma ọ ga-agbanwe onye bụ minista na-ahụ maka egwuregwu bụ Solomon Dalung nakwa ndị ọzọ. Mana @the_receptor chọrọ ka o nye onyeisi JAMB ọrụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ. @Kurtie66375842 chọrọ ka Buhari rụọ ụlọorụ ebe a na-esi mmanụ ọhụrụ nakwa rụgharịa ndị nke nọ anọ. @deoziz chọrọ ka Buhari lebanye anya n'ọnụọgụgụ pati ole dị na Naịjirịa nakwa mee ihe gbasara etu e si eme ntuliaka. @ErusiafeA chọrọ ka agha Buhari na-ebuso ndị merụrụ aka n'ọchịchị zuo ndị ọzọ n'ahụ, na-abụghị naanị ndị anọghị na pati ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51670114,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51670114,Coronavirus in Nigeria: Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha igbochi Coronavirus ịbata na Naịjirịa?,"Dịka ministri na-ahụ maka ahụike kwuputarala na ọrịa Coronavirus abatala Naịjrịa , ndị ọnụ na-erụ n'okwu akọwaala na ọ bụ ọrụ gọọmenti etiti ịhụ na ya bụ ọrịa abataghị na Naịjirịa.","Jimi Disu bụ onye ntaakụkọ ọnụ na-eru n'okwu, kwuru na ministri na-ahụ maka ahụike kwesịrị ịnọ n'isi ya bụ mgbochi ọrịa. Ọ kpọkwara aha ministri na-ahụ maka ọpụpụ na mbata a kpọrọ immigration na Bekee, nakwa Ministri na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Aviation na Bekee dịka ndị ọzọ kwesịrị iso na ya bụ ọrụ. Ọ sị na ọrụ ministri bụ ịhụ na e nyochara mmadụ niile na-abata n'ala a. Disu sị na ya bụ ọrụ abụghị ọrụ otu onye maka na a tụrụ anya na gọọmentị etiti kwesịrị ihibe kọmitii ga-ejikọta ndị niile ga-arụ ya bụ ọrụ. Otu a ka ha ga-esi hibekwa kọmitii ndị a na steeti niile bụ nke ha ga na-elekọta. Disu kwukwara na ""gọọmentị kwesịrị ịkpọrọ ọrụ mgbasaozi maka igbochi ọrịa mkpa, iji hụ na esi ụzọ dị iche iche zisaa ya bụ ozi"". Ka e si amata ọrịa Coronavirus Ka esi egbochi ọrịa Coronavirus Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya. Onwere ọgwụ mgbochi? O nwebeghị ọgwụ e ji agwọ maọbụ gbochie ọrịa a ka ọ dị ugbua, dịka otu mbaụwa ahụike bụ World Health Organisation si kwuo n'ọbaozi websaịt ha. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-43765268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43765268,Atụọla ogbunigwe n'ụlọọrụ ngwaagha kemịkal dị na Sirịa,"Mba Amerịka, Uk na Fransị agbala ogbunigwe n'ọtụtụ ụlọọrụ ngwaagha kemịkal nke gọọmentị Sirịa nwere.","Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ Mwakpo a bụ na nzaghachị mwakpo a sịrị na Sirịa jiri ngwaagha kemịkal mee n'obodo Douma nke dị na Sirịa na izuụka gara aga. Ogbunigwe dara n'isi obodo bụ Damascus, nakwa ebe abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs dịka Pentagon kwuru. Onye nnọchite anya mba Rọshịa na Amerịka zaghachịrị ma kwuo na mwakpo a emere ndị enyi ha ""agaghị abụ ihe efu"". Maapụ ebe ndị ogbunigwe a gbara ""Mba Briten, Fransị na Amerịka egosila ike nke ezi omume ha megide nkwarụ na obi ọjọọ"" Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru. ""Mwakpo a bụ iji guzosie ike n'imegide nrụpụta, mgbasa na iji ngwaagha kemịkal awakpo,"" dịka o kwuru. Mwakpo a bụ nke kachasị gbapụta ihe ndị ndu mpaghara ọdịdị anyanwụ na-eme kamgbe onyeisiala Sirịa Bashar al-Assad. Ihe ndị mmadụ na-ekwu; Onyeisila mba Sirịa bụ Bashar al-Assad ekwuola na mwakpo ga-eme ka Sirịa dị kwuo ike n'ibuso ndị na-eyi ndụ egwu agha. Assad boro ndị gọọmenti Amerịka na ndị ọzọ ebubo na ha na-akwado ihe iyi ndụ egwu. Gere ihe ndị mm Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43651658,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43651658,Sierra Leone: Maaida Bio abụrụla onyeisiala ọhụrụ,"Maaida Bio meriri Samura Kamara, onye pati nọ n'ọchịchị bụ All Peoples Congress (APC) na mmetọpụ ntuliaka e mere na ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Maachị.","Maada Bio chịburu mba Sierra Leone dịka onye agha Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na mba Sierra Leone bụ Mohamed Conteh, kwupụtara na Bio ji votu 1,319,406, nke pụtara pasenti 51.81 nke o nwetara n'ime 2,546,577 bụ ezi votu a tụrụ na ntuliaka were merie Kamara. Kamara nwetara votu 1,227,171 nke pụtara pasenti 48.19 n'ime ezi votu a tụrụ. Conte kwuru na ọ bụ mmadụ 2,578,271, nke pụtara passenti 81.11 ndị tinyere aha ha n'akwụkwọ ntuliaka sonyere na ntuliaka ahụ, ebe votu 31,694 bụ votu adabanyechaghị (invalid votes), Conteh sị: ""Site na ikike e nyere me dịka onyeisi ntuliaka site na iwu ntuliaka nke afọ 2012, ana m etinye aka n'akwụkwọ iji kwuo na dịka Bio Julius Manda nwetara votu 1,319,406 n'ime ezi votu a turu na mmetọpụ ntuliaka onyeisiala e mere n'abali iri atọ na otu nke ọnwa Maachị, na a họrọla ya dịka onyeisiala nke mba Sierra Leone. ""Onye ọbụla bụ onye Sierra Leone sonyere na ntuliaka nwere ike igbagha ntuliaka site na ide akwụkwọ mkpesa degara ụlọikpe kacha n'ala anyị tupu abalị asaa a ga, dịka iwu alanyị gbasara ntuliaka siri dị."" Maada Bio chịburu mba Sierra Leone nwa obere oge, mgbe ya na ndị agha otu ya weghara ọchịchị n'ike n'afọ 1992 ga bụ onyesisala nke ise nke Sierra leone dịka o jiri votu karịrị 92,000 merie ogbo ya onye APC. Bio ga ewere ọchịchị n'aka Ernest Bai Koroma nke APC, onye chịzuola agba abụọ nke bụ afọ ise,afọ ise. Ọ bụ pati iri anọ sonyere na ntuliaka nke mbụ mere na ụbọchị nke asaa nke ọnwa maachị, ebe e nweghị onye nwetara pasent 55 dịka iwu ala ha siri dị. Akụkọ ga-amasị gị:" 42905538,https://www.bbc.com/igbo/42905538,Ụlọikpe Kenya akwụsịla mmechi ụlọ ngosi TV,Mmechi a bụ maka na ha kwadoro igosi onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchị ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ.,"Achụpụrụ ndị ntaakụkọ nọ n'ikuku mana ha ji igwe mgbasa ozi youtube na-agbasa ozi iyi ọrụ ahụ Gọọmenti etiti mechiburu ụlọọrụ ngosi ndị ahụ maka na ha gbasara ozi gosịrị Raila Odinga ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ ma kpọkwa onwe ya onyeisiala mba Kenya. Odinga emerighị na ntuliaka emere n'afọ 2017, ebe a na-ahụta iyi ọrụ ahụ o duru onwe ya dịka ihe ""agwụ"". Otu onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara oke na ugwu ruru mmadụ bụ Okiya Omtata kpụpụrụ gọọmenti Kenya ụlọikpe ka ha kwụọ ndị ụlọọrụ ngosi ahụ e mechiri ụgwọ maka mmechi ahụ. Ego ndị ụlọọrụ ngosi TV furu ruru nde dola Okiya gwara ụlọikpe ahụ ka ha kpebie na mmechi ahụ emechiri ụlọọrụ NTV, KTN na Citizen TV megidere iwu. Onye ọrụ BBC nọ na Kenya bụ Ferdinand Omondi kwuru na ndị Kenya nọ na mwute maka ya bụ mmechi maka na ha anaghị enweta ihe ngosi masịrị ha. Ndị ulọọrụ ihe a metụtara kwuru na ego ha ruru nde dollar efuola maka na ha ereghi ahịa mgbasa ozi. Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 mana e megharịrị ntuliaka ahụ n'ihi na ndị ụlọikpe kagburu nke mbụ. Raila Odinga bụ onye ndu pati na-anọghị n'ọchịchị esonyeghị na ntuliaka mmegharị ahụ e mere n'ọnwa Ogostu afọ 2017." afirika-49918779,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49918779,Abdulrasheed Maina: Gịnị mere nnwuchi nwoke a jiri ada ebube?,"Ka ọ kwụ ugbua, ngalaba na-ahụ maka nchekwa Naịjirịa nke akpọrọ ""State Security Service"" (SSS) akpụrụla Adbulrasheed Maina kpụgara ndị ""Economic and Finiancial Crimes Commision"" (EFCC).","Dịka ndị SSS siri kwuo, ha nwuchiri Maina n'abalị iri atọ nke ọnwa Sepụtemba na ụlọ ndịna dị n'Abuja ka ndị EFCC rịọrọ ha enyemaka ịnwụchị nwa amadị a. Ndị EFCC kwuru na Maịna bụ onye a na-achọ achọ maka ebubo na aka ya dị na mpụ na nrụrụaka. Akụkọ ndị SSS na-akọ maka nnwụchi Maina na-atụ n'anya, mana ọtụtụ mmadu na-ajụ onye ọ bụ nakwa ihe o mere eji achọ ya. Onye bụ Abdulrasheed Maina? Maazị Maịna bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụgwọ ezumike akpọrọ ""Presidential Task Force Team on Pension Matters"" (PRTT) nke Goodluck Jonathan hibere mgbe ọ bụ onyeisiala. Ọ bụ n'afọ 2010 ka Jonathan họọrọ Maina ka ọ nọrọ n'isi ndị na-elebanye anya na mpụ dị n'ụgwọ ezumike nke Bekee kpọrọ 'Pension'. N'afọ 2012 e boro Maina ebubo oke nrụrụ aka gbasara ụgwọ ezumike nka ndị mmadụ ruru ijeri narị narịa. Ngalaba ụlọ omeiwu a kpọrọ ""Commitee on Public Service and Establishment and State and Local Government Administration"" nyochara ebubo a ma maa Maina ikpe. Maina kpụpụrụ ngalaba ụlọ omeiwu a na onyeisi uweojii Naịjirịa ụlọikpe. Ka o mechara nke a, onweghịzi onye hụrụ Maina anya ọzọ, nke mere ndị uweojii jiri sị na ha na-achọ ya achọ. Gọọmentị chụrụ ya n'ọrụ ma wepụ okwu ya ụlọikpe. N'afọ 2015, EFCC kpụpụrụ maazị Maina na onye bubụ onyeisi ndi ọrụ gọọmentị bụ Steve Oronsaye na ndi ọzọ ụlọikpe. Ka ndị ọzọ si na-aka ha dị ọcha, anya ahụghị Maina. Maina sepụtere isi ọzọ n'afọ 2017 mgbe gọọmenti Buhari weghacitere ya n'ọrụ ma bulie ya n'ọkwa. Ka mba dawara ebe niile maka atụmatụ a, onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a chụo ya ozugbo. Onye weghachiri ya n'ọrụ? Maazi Maina na-esi ọnwụ na Onyeisiala Buhari ma maka nlaghachite ya. Winifred Oyo-Ita bụbu onyeisi ndị ọrụ na Naịjirịa sị na aka ya adịghị ya. Akụkọ kwuru na onye bụbụ Minista na-ahụ maka ime Naịjirịa bụ Abdulrahman Dambazau na Minista na-ahụ maka ikpe bụ Abubakar Malami ma maka ihe a mere. Etu o sikwuru ugbua Ndị SSS si na nwa Maina bu nwata akwụkwọ miri egbe mgbe ha zutere ya na nna ya. Ha kwuru na ọ bụ n'ime ụgbọala mgbọ egbe adịghị abanwu ka anwụchịrị ha abụọ. Maazị Maina na nwa ya nọ n'aka ndị EFCC ugbua na azara ọnụ ha. Anya anyị ga-adị n'okwu iji mara etu ọ ga-esi gaa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa'" afirika-49124343,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49124343,Shia in Nigeria: Ịkpọ anyi ndị oyi egwu agaghị abara gọọmentị uru ọbụla - Onye Shia,Onyeisi ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) nke Ọdịda Anyanwu nke Naịjirịa bụ Muftau Zakariya gwara BBC na akụkọ na gọọmentị chọrọ ịkpọ ha otu na-eyi obodo egwu adịghi amapụha obi.,"Ndị Shia na-eme ngaghari iwe kemgbe 2015 Muftau Zakariya na-etinye ọnụ na-akụkọ ụlọ ntaakụkọ Punch dere sị na ụlọikpe ukwu n'Abuja kpebiri na ndị Shia so n'otu na-eyi obodo egwu - bụ nke Bekee kpọrọ ""terrorist group"". Muftau Zakariya jụrụ; ""ọ bụ gini mere gọọmetị erubehị isi mgbe ụlọikpe nyere iwu ka atụhapụ Ibrahim El-Zakzaky?"" Ọ jụkwara ma ọ bụzi iwu mmachi ha ka gọọmentị ga-erubere isi? Ọ ga-kwara n'ihu kwuo na uche ya bụ na ihe bụ usoro gọomentị ji chọrọ ịmachị ha. ""Ya bụru na ha sị na anyi bụ ndị oyi egwu, ịmara na onye ọbụla bụ onye Shia bụ onye oyi egwu. Nke a metụtara ma ndị uweojii, ndị na-arụ ọru dị iche iche nakwa ndi so na gọọmentị bụ ndi Shia."" Mufta kwuru na imachi ha dịka imachi ngalaba ndị nke kraịst dika Catholic ma o bụ ndị Ama Jehova. Zakzaky malitere otu IMN mgbe ọ bụ nwata akwụkwọ na Mahadum ABU Okwu ịmachị otu a bidoro fegharịwa ka ha na ndị ọrụ nchekwa na akwakọ isi n'Abuja dịka ha na-eme ngagharị iwe maka okwu Ibrahim el-Zakzaky. El-Zakzaky nọ n'aka gọọmentị kemgbe afọ 2015. Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere ubọchị 22 nke ọnwa Jụlaị na gọọmentị na-ahazị ịmachị ya bụ otu. Muftau Zakariya gara n'ihu kwuo na ụjọ adighị ha ma kwuo kwa na ha dị njikere inwu maka nzọpụta onyeisi ha ma na ajụ kwa gọọmenti etiti na ha enwere ụlo mkpọrọ ka ajide ndị otu ha ruru mmadu nde iri na atọ. BBC gbara mbọ ịnwete ndị na-ekwuru gọọmentị ka ha kwuo ma atụmatu a akuko sị na o si ụlọikpe pụta ọ bụ eziokwu, mana Garba Shehu, Femi Adesina na Laulu Akade asaghị mgbe ekwenti ha dara. Bashir Ahmad, bụ onye na-enyere Onyeisiala Muhammadu Buhari aka n'ihe banyere mgbasaozi agba ọhụrụ, gwara BBC na ya amaghị maka ya bụ atụmatụ. Ngagharị iwe ndị Shia na-eme ""Anyi ka si Liberia bata. Ndị ga-ama maka ya bu ndị ọru ikpe."" Ya bụ, BBC ka na-eme nchọpụta ma akụkọ ọ bụ eziokwu. Dika Muftau Zakariya sị na ndị Shia dị nkwadobe ime ike ha ma hụ na onyeisi ha pụtara, ihe ji agadi n'ukwu ka jikwa ya. Ọtụtụ mmadu anwụọla site na ya bụ ngaghari iwe dịka ndị Shia na ndị ọrụ nchekwa na-akwakọ isi - N'ime ha bụ onyeisi ngalaba ""Operations"" n'Abuja bụ DCP Usman A.K Umar, onye ntaakụkọ Channels nakwa ndị ofufe Shia. Akụkọ ka na-abịa Ọgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja" afirika-44615283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44615283,Ị chọrọ ịzụ ntutu gị? Lee etu ị ga-esi me ya n'ime usoekwu gị,Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịzụ ntutu ekwuola n'ihe kacha mkpa na-eme ka ntutu mmadụ too ọkachasị ndị Afịrịka bụ iri ezigbo nri.,"Nke a pụtara na ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri zuru ezu, ntutu onye ahụ n'akụkụ ahụ ya niile ga na-anata ihe ọ ga-eji na-eto. Ugbua ndị Afịrịka na-etinye uchu na ịzụ ntutu ha etu ọ dị karịa ite ya kemikal, ọtụtụ nchọpụta adịla n'ihe e ji azụ ntutu na-anaghị emerụ ahụ maọbụ nwee ihe mmekpa ahụ ọbụla. Nke a mere na ọtụtụ ihe e ji eme isi bido na nke e ji asa ya asa rue na nke e ji eme ka ọ dị juu dị n'ime ụsọekwu. Lee ihe ntutu gị chọrọ n'ime ụsọekwu gị 1. Mmiri: Ndị Igbo na-ekwu na mmiri enweghi onyeiro. Onweghi onye enweghi mmiri n'ụlọ ya maọbụ n'ụsọekwu ya, ịnụ mmiri nkeọma anaghị edozi ahụ naanị ya, ọ na-eme ka ntutu gị nwere mmiri zuru oke ọ ga-eji na-adị jụụ. Mmiri enweghi onye iro Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ntutu ekwuola na mmiri bụ otu ihe dị mkpa na ntutu mmadụ nakwa n'akụkụ ahụ mmadị niile. Mana otu ihe ọtụtụ ndị mmadụ anaghị enwetacha bụ na ha na etinye mmiri n'isi ha naanị ya chefuo itinye n'ime ahụ ha site n'ịnụ ya anụ nke dịkwa mkpa ka ibe ya. Ị na-achọ ka ntutu gị too eto, ịnụ mmiri dị mkpa ebe ị ga-agbakwa mbọ hụ na ị nwere iko i ji agba mmiri na ntutu gị oge niile o ghere oghe ka ọ ghara ịkpọ nkụ sie ike maka itibisi. 2. Mmanụ: Mmanụ dị icheiche ka a na-enweta n'ụsọekwu dịka mmanụ akị Bekee, mmanụ ""Olive"" na mmanụ akwụ. Maka ntutu, ihe anyị ga-ekwu maka ya bụ mmanụ akị Bekee na mmanụ ""Olive"". Ndị ụfọdụ na-ejikwa mmanụ akwụ mana anyị agaghị ekwu maka ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ata akị Bekee maka na ọ na-atọwa ntị mana ọbụghị naanị ịta ka a na-eme ya. A na-ejikwa ya eme mmanụ e ji esi nri nakwa e ji eghe ihe mana e jikwa ya eme isi. Otu ihe mmanụ na-arụ bụ inye aka jide mmiri ị na-aṅụ na nke ị na-etinye na ntutu gị. Ọ na-emekwa ka ntutu na-enwuka enwuka n'ala isi. Mmanụ Olive dịkwa mkpa nke ukwu maka na ọ na-aba n'ime ntutu ma jide mmiri nke ọma. Ihe nke a gosiri bụ na ọbụghị naanị ndụ gị ka ị ga na-atụ mmanụ, ị ga na-atụkwa ntutu gị mmanụ. 3. Mmanụ aṅụ: Ọbụghịzikwa naanị nracha maọbụ iji rie nri, mmanụ aṅụ nwere ọtụtụ akụrụngwa na-eme ọ ji bụrụ akwa a kwụrụ n'ebe ahụike nọ. Mmanụ aṅụ na-arụ ọtụtụ ihe dị icheiche mana nke gbasara anyị ugbua bụ maka ntutu. Otu onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ntutu bụ Chinyere Okolo kwuru na mmanụ aṅụ bụ otu ihe ntutu na-anara na-anaghị akarị akarị. Mmanụ aṅụ na mmanụ Olive bụ akụrụngwa abụọ ị ga-eji mee ka ntutu gị daa jụụ ghara ịra ahụ ịvọ. Were ọkara iko mmanụ anụ, tinye ya n'ime otu ngaji mmanụ, gwọkọọ ya ma tee ya na ntutu gị niile rue n'ala isi gị. Were okpu nchemmiri kpuchie ya buo ya rue ihe dịka nkeji iri abụọ tupu ị sapụ ya. Nke a ga-eme ka ntutu gị bụrụ a kwaa akwụrụ. 4. Akwa: Nke na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ mana ọtụtụ anaghị enweta etu e si eji ya eme isi. Ị ga-akpacha anya etu isi etinye akwa n'isi maka imebi ihe Akwa bụ otu ihe na-eto ntutu maka akụrụngwa protin dị ya. Mana ọbụghị akụkụ akwa niile ka mmadụ kwesiri itinye n'isi. Ụdị ntutu mmadụ nwere ga-ekwu akụkụ akwa ọ ga-etinye n'isi. Nke a pụtara na onye nwere ntutu na-akpọ nkeụ oge ọbụla ekwesighi itinye akụkụ na-acha ọcha n'isi ya. 5: Ube oyibo: Nke a na-amasị ọtụtụ ndị na-eme isi maka na ube oyibo nwere mmanụ dị mma maka ntutu. Ube abụụghịkwa naanị maka ịracha aka, i nwereike iji shie ntutu gị eshi, o ghee eghe. Ị ga-apịrịnwu ube tinye ya akụrụngwa ndị ọzọ jiri ya tinye n'isi, bue ya ụfọdụ oge tupu ị sapụ ya. Ihe ndị ọzọ i nwereike iji mee isi Agbanyeghị ihe ọbụla mmadụ tinyere n'isi, otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na ị naghị eri ihe nke ọma, ị mara na otu abụghị n'ezi. Rie nri nke ọma maka na ihe tinyere n'ahụ ga na-apụta na-egosipụta n'akụkụ ahụ gị niile. Uru ịkpa isi bara Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49432479,https://www.bbc.com/igbo/49432479,"Cabinet Inauguration: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ngige, Onu, Fashola na ndị ọzọ","Obi adịghị ndị otu ndịọrụ a kpọrọ ""Nigeria Labour Congress"" mma etu e si họpụta Chris Ngige dịka mịnịsta na-elekọta ndịọrụ ọzọ.","Onyeisiala Buhari na Chris Ngige Ha kwuru na Ngige bụ onye okwu na ụka na-atọ bịrị bịrị. Yaqub Denja, otu n'ime ndị isi NLC, kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ụbọchị Tọọzde. Denja kwuru na o wutere ha n'obi nke ukwuu na onyeisiala Muhammadu Buharị họpụtakwara Ngige ọzọ. ""Ọ dị mwute na onyeisiala ga-akpọghachite nwoke a okwu na ụka na-atọ ka nnu."" ""Onye na-aghọtaghị ihe gbasara ndị ọrụ. Onye na-amaghị etu e si eweta udo ebe ọgbaaghara dị."" ""Mkpọghachi Ngige gosiri na onyeisiala chọrọ ka afọ anọ na-abịa abịa bụrụ nke juputara n'ọgbaghara n'etiti goomentị na ndị ọrụ."" Denja Yaqub Denja gara n'ihu kwuo na ""ọ bụ Ngige mere na-akwadoghi mbuli ụgwọ ọnwa opekatampe n'oge"". O kwuru na Ngige anaghị eleba anya na mkpesa ndị ọrụ ganye na ha agbaa abụbụ ọrụ. ""Ọ bụru na nghọtahie dị n'etiti ndị ọrụ, Ngige ga-eme ya ka ọkawanye njọ kama ọ ga-eweta ogbugbo."" Denja kwuru na NLC ga-ezipụ akwụkwọ ozi maka nhọpụta Ngige n'oge adịghị anya. N'otu aka ahụ, Kelechi Nwosu, onye ihe gbasara akụnụba doro anya, kwuru na ndị ọrụ gbara abụbụọrụ ugboro ugboro n'ime afọ anọ gara aga, nke gosiri na Ngige arụghị ọrụ ya nke ọma. ""Ma ndị nkụzi mahadum, ma ndị dibia bekee, ha ncha gbachara abụbụorụ."" ""Oleekwanụ ihe e ji kpọghachị ya n'ọrụ."" ""Ọ bụ eziokwu na e buliri ego opekatampe ndị ọrụ, mana ọ bụghị ebe ahụ ka okwu bere."" ""Ụgwọ ahụ e weliri, a kwụwala ya?"" Ogbonnaya Onu na Adamu Adamu N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụ Naijiria ekwugidela nhọputagharị onyeisiala Buhari họpụtara ụfọdụ ndị mịnịsta dịka Ogbonnaya Onu na Adamu Adamu. Dịka o siri gbasa Ogbonnaya Onu, Nwosu gwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị mịnịsta ahụ ekwesịghị ịlaghachite azụ. ""Onu arụghị ihe ọbụla a hụrụ anya na ngalaba sayensi na teknụzụ."" ""E kwesiri ịhọpụta onye ma ihe ekwe na-akụ dịka mịnịsta teknụzụ. ""Ebe obodo Naijiria nọ n'ihe gbasara ichepụta ihe (innovation) dị anya. ""Ị jụọ m, ekwesịghị iweghachi mịnịsta a ọzọ. ""Ya na mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ (Adamu) bụ otu ihe, he ekwesịghị ka akpọghchị ha n'ọrụ"". Mịnịsta ndị mere ọfụma Buhari na-ekele Fashola N'aka nke ọzọ, Nwosu kwuru na Fashola, bụ mịnịsta e tinyere na ngalaba ọrụ na ụlọ obibi, mere nke ọma n'agba nke mbụ ya. O kwuru na Fashola kwesịrị ka a kpọghachi ya azụ. ""I lee anya n'ihe gbasara ịrụ ụzọ, ọ gbalịrị agbalị nke ọma. ""I lekwaa anya n'ihe gbasara ụlọ ọ gbalịkwara. ""Ugbua, e meela ka ngalaba ọrụ na ụlọ dịịrị onwe ya, anyị na-ele anya na ọ ga-eme karịa ka o mere na mbụ."" Zainab Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba Gbasara Zainab Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba, Nwosu kwukwara na olileanya dị na ọ ga-eme ọfuma. ""N'agbanyeghị na ọ bịara ọhụrụ, a na-enye ya nsọpụrụ pụrụ iche n'ihe gbasara atụmatụ akụnụba. ""Ọ ga-na elekọtakwa ngalaba mkpata na mmefu nakwa nhazị obodo. ""Ka anyị legodu ya anya mara ihe ga-apụta n'ime ya."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Vicky Nwogu" egwuregwu-44626331,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44626331,World Cup 2018: Ihe mere Super Eagles jị pụọ,Akwa ka na-akpọtụ n'elu Soshal Midia maka mmeri Ajentina meriri Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi Iko Mbaụwa ụnyaahụ.,"Cuneyt Cakirr bụ onye ogbu bọọlụ nke uwku n'asọmpị dị iche iche Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ gịnị mere udi ihe a ji eme ndị Super Eagles ma ọ bụ otu ndị ọzọ si na mpaghara Afrịka? Ugbu a, ọ bụ naanị otu bọọlụ Senegal ka fọrọ n'asọmpi Iko Mbaụwa. Cheta na kemgbe amalitere asọmpi Iko Mbaụwa, onwebeghi mba si mpaghara Afrịka rurula agba nke anọ n'asọmpi a. Gịnị butere udi ihe a? Gụọ ihe ndị mmadụ na-ekwu. Egwuregwu bọọlụ abụghị nke anyị Anyi enweghị ngwa ọrụ ịgwado egwuregwu bọọlụ Blessing Nwosu bụ onye ama ama dịka onye na-apụta n'ime ihe nkiri gbasara egwuregwu bọọlụ kọwara na ha na-agbapụ otu si mpaghara Afirika n'asọmpị iko mbaụwa na-afịa makana egwuregwu bọọlụ abụghị ihe si n'aka anyị pụta. Nwosu kwukwara na ""Ọ bụrụ na i lee anya ka ndị Afrịka si agba bọọlụ nke ha, i ga-ahụ na ha chọrọ ịgba ka ndị ọcha sị agba bọọlụ nke ha."" Ọ kọwara na ihe a mere ike na-apụ ha n'arụ tupu ha gbachasịa. Nsogbu anyi bụ nkpa ịkpa bọọlụ Anyị na-agba bọọlụ nke ọma mana oruo oge ọ kachasi mkpa anyị adaa Mana nwata nwoke aha ya bụ Kenneth Umerie ekweteghị n'ihe Nwosu kwuru. Ọ gwara anyị na, nsogbu anyị abụghị na anyi bụ ndị Afrika, cheta na etuola nwoke aha bụ Samuel Eto sị mba Ghana ugo dịka onye kachasị agba bọọlụ nke onye atọ na mba ụwa niile n'afọ 2005. Nsogbu anyị bu na anyị enweghị ezigbo nkpa ịkpa bọọlụ. Ọ bụ ndị agadi nwoke na-agba bọọlụ n'Afirika Anyị chọrọ sọọsọ ndị na-agba ọfụma n'otu ha Stephen Mbonu bụkwa onye ọzọ na-akwadọ bọọlụ kwete n'ihe Umeruo kwuru. N'uche ya, mmeri ha na-emeri ndị otu Afirika bụ makana ọtụtụ ndị egwuregwu anyi anaghị ekwu ezi okwu gbasara afọ ha ji mụ ha. Mbonu kwukwara n'egwuregwu bọọlụ, ịnaghị eji onye dị afọ iri abụọ tunyere onye dị afọ iri atọ. Ihe a kwesiri ị kwụsị kpam kpam n'egwuregwu anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-emeri ndị ọcha n'asọmpị iko mba ụwa. Onye ọzọ aha ya bụ Nnamdi Nwosu kwuru na ihe anyị kwesiri na-eme ugbua bu ịchọpụta onye ga-elebaanya nkpa ịkpa ịgba bọọlụ. Nwosu kwuru na onye a bụ onye kwesiri ị nwere ọtụtụ ahụmahụ na nchikọta ịgba bọọlụ. Blessing Nwosu kwekwara na nke a. O kwuru na anyi kwesiri ibido ịhọpụta ndị ọhụrụ ga bụ ndị ọgba bọọlụ Afirika n'ihu. Amaghị m ihe mmere enyeghị m Naịjirịa penariti ahụ - Ogbubọọlụ Aha ya bụ Cuneyt Cakirr sị mba Tọkị. N'elu na twitter na Instagram ndị mmadụ na-akpọ ya iyi makana ọnyeghị penariti. Nke a bụ nke mbụ ndị Naijiria chakwasị onye ogbu bọọlụ otua, na-akpọya iyi dị iche iche. Onye ọgba bọọlụ Super Eagles bụ Mikel Obi kwuru na mgbe agbachara asọmpị ahụ, Cakirr kwuru na ya-aghọtaghị ihe mere o nyeghị Naijirịa ohere ịgba penariti ahụ. Cuneyt Cakirr bụ onye ogbu bọọlụ nke uwku n'asọmpị dị iche iche Super Eagles ji obi ngbawa alaghachịta Naịjirịa World Cup 2018: Super Eagles ji obi ngbawa alaghachịela Naịjirịa Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49392543,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49392543,World Mosquito Day: Ọrịa anwụnta na-ebute na etu ị ga-esi gbochie ọtịta ya,Ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọstụ bụ ụbọchị e kewapụtara maka icheta ụbọchị a chọpụtara na ọ bụ anwụnta nke nwaanyị na-ebute ọrịa ịba.,"Anwụnta na-ebute ọrịa ịba na-emetụta ihe ruru nde mmadụ abụọ kwa afọ, dịka ngalaba World Health Organisation si kwuo. Ọtụtụ ndị na-akpọ ""anwụnta, anwụnta"", mana mmadụ ole ma na ọ bụghị naanị otu ụdịrị anwụnta dị? Dịka ọ bụ ụbọchị anwụnta, BBC Igbo chọrọ ịkọwara gị maka anwụnta, ọrịa ọ na-ebute na etu ị ga-esi gbochie ya. Ụdịrị anwụnta dị: E nwere ọtụtụ anwụnta n'ụwa, karịrị nde, mana naanị ụfọdụ bụ ihe ndị mmadụ ma maka ya. Ebe anwụnta na-amịta ọbara n'ahụ mmadụ Ọrịa anwụnta na-ebute Akụkọ a ga-amasị gị: Etu ị ga-esi gbochie anwụnta ịta gị n'ogige gị: 1) Itinye neetị (akwa mgbochi): Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa a kpọrọ 'World Health Organisation - WHO' na-eke neetị aghara aghara iji nyere aka gbochie anwụ nta. Nke a so n'usoro e si achụ anwụnta na-anaghị eri oke ego, ma gharakwa imebi ihu igwe a kpọrọ 'ozone layer'. 2) Ịgba ọgwụ kemịkal: Nke a bụ usoro Bekee kpọrọ 'fumigation', nke bụ etu e si achụpụ ma gbuo ọtụtụ anwụnta site n'ịgba kemịkal ebe ha nọ. Nke a na-enye aka igbu anwụnta ndị na-anọ n'ime ọwara mmiri adịghị ọcha nakwa n'ime nkọrọ dị aṅa. Akụkọ ka na-abịa Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: ‘Ịkpa ụmụanụmanụ dọpụtara m n’echiche ịkwụ ụdọ’" afirika-49773652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49773652,Anambra State Assembly : Oku anyị kpọrọ gọọmentii etiti abụghị ka ha bịa weghara Air Peace,Ndị omeiwu Anambara steeti ekwuola na ihe mere ha jiri kpọọ gọọmenti etiti oku ka ha mee ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace ụgbọelu Naijiria bụ ka ụgbọelu ahụ nweta nkwado pụrụ iche n'aka gọọmentị.,"Pascal Agbodike, Allen Onyema na ụgbọelu Airpeace Ndị ụlọomeiwu steeti ahụ nọrọ n'ọgbakọ ha kpebie ma kpọọ gọọmenti etiti oku ka ha were Air Peace mee ụgbọelu ala Naijiria iji kelee ụlọọrụ ụgbọelu ahụ maka ịkpọlata ụmụ Naijiria n'efu dịka nsogbu Xenophobia dagịdere ha na Saụt Afrịka. Osote Onyeisi ụlọomeiwu Anambra steeti bụ Pascal Agbodike gwara BBC Igbo na oku ahụ o bulitere okwu ya n'ọgbakọ ha bụ iji mee ka Air Peace siwanye ike.. 'Ihe mere anyị ji chọọ ka gọọmenti mee Airpeace ụgbọelu Naijiria' Pascal Agbodike gara n'ihu kọwaa na oku ahụ ""abụghị ka gọọmentị etiti weghara Air Peace, na-eri uru na ọghọm,"" Kama ọ bụ ""ka gọọmenti nye ha nkwado ego, na nkwado ime ka ihe na-agara ha siriri werere site na atụmatụ ha."" ""Ka anyị hapụzie ịchọwa ụgbọelu nke anyị."" Cheta na Air Peace si Saụt Afrịka bulata ụmụ Naijiria karịrị nari ise na nsonso a. Onye nwe ya bụ Allen Onyema, onye Mbosi n'Anambara steeti. Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka Akụkọ ga-amasị gị:" 51152992,https://www.bbc.com/igbo/51152992,Justice for Chima: Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ọrịa shuga gburu onye nwụrụ n'ogige ha,Ndi uweojii na Pọtakọt nke Rivas steeti ekwuola na n'ezie na onye 'mekanik' aha ya bụ Chigozie Ikwunado nwụrụ n'ogige ha dịka ha jichiri ya.,"Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya Mana dịka ọ na-ewu na soshal midia na e gburu ya egbu, ndị uweojii na-ekwu na ọ bụ ọrịa shuga gburu nwa amadi ahụ ka ọ nọ n'aka ha n'ogige ha dị na Mile One, Pọtakọt. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni gwara BBC sị: ""Anyị ma maka ihe mere nakwa ihe ndị ụlọọrụ ntakụkọ na-ekwu na ịntanet."" ""Dịka m nọ ugbua mụ na onyeisi otu ndị uweojii 'E-Crack' bụ SP Benson Adetuyi nọ."" ""O kweere nkwa na ọ ga achọpụta ihe mere nwoke ahụ nwụrụ na mkpọrọ ndị uweojii."" ""Oge ha mechara nnyocha ozu ya, o gosiri na obu oke shuga dị ya n'ahụ."" Akụkọ na-efegharị na soshal midia nke si n'ọnụ ndị mara Chima na-ebo ebubo na ndị uweoji kugburu Chima dịka ha jichichara ya n'ihi ịgba ụgbọala n'okporo ekwesịghị maka na ọ jụrụ inye ha aka azụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-50202766,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50202766,Natural Resources: Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya,Imo steeti so na steeti na-emepụta mmanụ agbịdị na Naịjirịa.,"Ụmị mmanụ agbịdị dị n'Imo steeti karịrị otu narị na iri isii. Ụmị ndị dị n'obodo iri na abụọ na steeti ahụ Mana ọ bụghị naanị mmanụ agbidi bụ ihe akụ ọnatarachi dị na steeti ahụ. Lee ndị ọzọ ebe a dịka nchọpụta ngalaba 'Raw Materials Research & Development Council' si kwuo. 1) Zinc Zinc Zinc bụ ụdị igwe e si n'ala egwupụta. Chaịna, Peru nakwa Ọstrelia bụ mba ndị e ji mmepụta 'zinc' mara. Ọ na-enye aka na mmepụta ọkụ latrik. A gwakọọ 'zinc' na 'copper', e nweta 'brass'. E nwekwara 'zinc' nke na-edozi ahụ. Ihe ndị ọọ e ji 'zinc' emepụta bụ rọba, mmanụ e ji ete ụlọ (paint), na kemịkalụ ụfọdụ. Na mpaghara ụfọdụ n'Okigwe na Orlu ka e nwere 'zinc' n'uju. 2) Gypsum Gypsum Gypsum bụ ụdị nkume e si n'ala egwupụta. Ihe e ji ya arụpụta gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP). E jikwa ya eme ka ala kawanye mma iji kọọ ihe. Ebe ị ga-ahụ 'Gypsum' bụ n'Okigwe. 3) Lead E ji 'lead' arụpụta batịrị Otu ihe kacha mkpa e ji 'lead' emepụta bụ 'battery'. 'Battery' bụ ihe na-enye ụgbọala, ọgbatumtum, ekwentị na ihe ndị ọzọ ike. E jikwa lead emepụta igwe na ihe ndị ọzọ. Okigwe na Orlu nwere 'lead' n'uju. 4) Limestone Igwe e ji akwọri 'limestone' Ihe e ji 'limestone' arụpụta buru ibu. Ha gụnyere 'cement', 'ceramics' na ihe ndị ọzọ. 'Limestone' na-aka mfe igwupụta karịa nkume ndị ọzọ. Ebe e nwere ya n'Imo Steeti bụ na mpaghara Ohaji-Egbema na Okigwe. 5) Kaolin 'Kaolin' 'Kaolin' bụ ụdị nkume ọcha na-akwọ mụrụmụụ. E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics', werekwa ya arụ ọgwụ na-akwụsị otoro maọbụ afọ ọsịsa. Kaolin dị n'Ehime Mbanọ, Isu nakwa Oru North. 6) Lignite 'Lignite' na-enye igwe na-emepụta ọkụ latrik ike Lignite bụ ụdị 'coal'. Mana ọnaghị eji uji nke ukwu dịka 'coal' ndị ọzọ. A naghị ejikarị 'lignite' akwọ ụgbọ oloko (train). Ebe ọ na-aka egbo mkpa bụ na mmepụta ọkụ latrik. 'Lignite' dị n'akụkụ ụfọdụ n'Orlu'. 7) Bentonite Clay Aja ụrọ 'bentonite' Na mpaghara Ideato South nakwa Isu ka e nwere 'bentonite'. Nke a bụ ụdị aja ụrọ na acha ọcha. Ọ na-enye aka n'igwu ụmị dị icheiche dịka ụmị mmiri nke Bkee kpọrọ 'Borehole'. Ọrụ ya bụ igbochi mmiri ịba ebe achọghị ka ọ baa. 8) Ndị ọzọ Gọvanọ Imo Steeti, Emeka Ihedioha, gara ilegharị anya n'Oguta 'Lake' Obodo dị icheiche n'Imo Steeti nwere ọtụtụ emume ọdịnala mara mma nke ukwu. Ọ bụrụ na e lebaa emume ndị anya ma mezie ya nke ọma, ọ ga-adọta ndị mmadụ ka ha na-abịa njem nlereanya na steeti ahụ. Bịa tinyekwara oshimiri Ugwuta nke a na-akpọ 'Oguta Lake' na Bekee. Ụdị ihe a bụ ihe na-amasị ndị njem nke ukwu. Imo bụkwa steeti ala ya na-emepụta nri nke ọma. Naanị nkọpụta nri, ma e mezie ya ọfụma, nwere ike inye gọọmentị Imo nnukwu ego. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu" afirika-44144825,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44144825,Sịneti: Uru dị n'iwu azụmaahịa ọhụrụ ehiwere,Na nzụkọ ndị Sineti mere ụnyaahụ bụ ebe ha hiwere iwu ọhụrụ akpọrọ Company and Allied Matters Act n'olu Bekee mgbe agụpụtara ya nke ugbo atọ.,"Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti Onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki kelere ndị Sịnetọ maka nke a, kwuo na ọ bụ oke ihe ha mere na njem ha ime iwu n'ala Naịjirịa. ""Anyị ehiwela usoro iwu dị mkpa iji kwalite azụmaahịa na ibelata oke ihe mgbochi dị n'azụmaahịa na Naịjirịa. Nke a bụ iji kwuo n'ezie na anyị dị njikere ịzụahịa na Naịjirịa, i nyere ndị azụmaahịa nta aka, nakwa ịrụpụta ihe ọhụrụ ma kwalite azụmaahịa."" Saraki kwuru. End of Twitter post, 1 Ụfọdụ uru dị n'ihiwe iwu a gụnyere: BBC Igbo gbara otu onye azụmaahịa bụ Ike Chidiebere ajụjụ. O kwuru na iwu a dị mma mana gọomentị kwesiri ịkọwara ndị azụmaahịa na-agụghị akwụkwọ ihe nke a pụtara. Chidiebere kwuru na ndị ụlọọrụ National Orientation Agency kwesiri ị bata n'ime ahịa nakwa obodo kọwaa uru dị n'iwu ọhụrụ a. Na nke a ga-eme ka ndị mmadụ tinye uchu n'ime azụmaahịa n'ala Naịjirịa. Gere ihe o kwuru ebe a: Sịneti: Uru dị n'iwu azụmaahịa ọhụrụ" afirika-45268165,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45268165,Lee ihe ndị I kwesiri ime iji gbalahụ 'prostate cancer',Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọtala ọnụ n'Okpara Square dị n'Enugwu iji mee ngagharịiwe megide ọrịa 'Prostate Cancer'.,"Ngagharí iwe prostate Cancer 'Prostrate Cancer' bụ ọrịa ọjọọ na-adị n'akpa mamịrị ụmụnwoke, bụ nke gburula ọtụtụ ụmụnwoke. Onye hiwere ngagharịiwe otu ""pink blue"" ahụ bụ mazị Roncy Chidebe kwuru na ya na ndị otu ya chọrọ ka ụmụnwoke niile teta n'ụra, gaa nyochaa onwe ha. Chidebe kwuru na Onye ọbụla chọpụtara nke ya n'oge nwere ike igwọta ya tupu ọghọọ Cancer. Onye ọzọ sokwa chịkọba ya bụ ngagharịiwe bụ Ọkanmụta Peter Ebigbo gwara ụmụnwoke ka ha ghara ịdị na-edị orịa, kama ka ha gaa nyocha ngwa ngwa ha nwere nsogbu inyụ mamịrị. Ndị mmadụ, ma nwoke ma nwaanyị na-agba ọsọ kwa ụbọchị n'Okpara square soro ndị otu Pink blue gbaa ọsọ ngagharịiwe ahụ. Ndị dibia bekee nọ kwa ebe ahụ na-ele ndị mmadụ ahụ n'efu. Onye ọrụ ahụike na-achịkọba ya bụ nyocha Prostate Cancer bụ Nonso Nwosu, nyere ndụmọdụ ka nwoke ọbụla gbara afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise gbalịa na-aga ụlọọgwụ kwa mgbe kwa mgbe maka nyocha Prostate Cancer. Nwosụ kwuru na-achọpụtara ọrịa prostate n'oge, enwereike ịgwọta ya." afirika-44693652,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44693652,Atiku: Achọghị ndị mba ọzọ iji PVC adịgboroja wakpo ntuliaka Naịjirịa,Obi adịghị onye bụbụ osote onyeisial;a naịjirịa bụ Atiku Abubakar mma maka akụkọ na webụsaịtị Alibaba.com na-ere kaadị itu vootu Naịjirịa bụ PVC n'aha ịchafụ.,"Akụkọ a pụtara kamgbe ụbọchị ụka dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec pụtarala kwuo na ha na-etinye anya na ya bụ akụkọ. N'akwụkwọ ụlọọrụ Inec depụtara na webụsaịtị ha, ha kwuru ka mmadụ niile hie asaa n'anya ma ghara ịga ebe ọbụla zụọ PVC maka na ha agaghị ejinwu ya mee mbinyeaka. Mana Atiku bụkwa onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 ahụ n'okpuru pati PDP dere akwụkwọ na kaadị ahụ a na-ere ewetuola ntukwasị obi e nwere ebe ndị Inec nọ nakwa nchekwa obodo. N'okwu ya; ""Mwakpo nchekwa anyị na-emetụta maka na ọ na-emetụta ohere Naịjirịa nwere iji wulie ngalaba siri ike dịka Inec. ""Ụdị ihe dị otu a nwere ike imepe ụzọ ịzụ vootu nke ga-emebi mbinyeaka dị ọcha nke Naịjirịa chọrọ ime na 2019."" Atiku gwakwara Jack Ma na Naịjirịa jikwaa PVC mee ntuliaka n'afọ 2015 na-enweghi mwakpo ọbụla agbanyeghi na webụsaitị ya bụ Alibaba.com dịkwa oge ahụ. Nwaanyị na-ahụ maka nkuzi itu vootu na mpaghara ọwụwa anyanwụ N'okwu Atiku; ""Nke a gosiri na alibaba.com anaghị enyefe onwe ya n'aka ndị chọrọ itisa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa na 2019."" Atiku rịọrọ Jack Ma ka o jiri ikike ya gbaa mbọ hụ na kaadị ahụ alọghachiteghi azụ na webụsaịtị ya. Ọ rụtukwara aka na ebubo mwakpo a na-ekwu mere na ntuliaka ndị Amerịka n'afọ 2016 nke mba dị icheiche a na-atụ aka gọnarịrị, ma na ya bụ ebubo rapụtara ọtụtụ ụlọọrụ dịka Facebook, Cambridge Analytica na Twitter. Atiku kwuru na arịrịọ ya bụ ka a ghara inwe ụdị ebubo a na ntuliaka Naịjirịa na 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49177631,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49177631,Islamic Movement of Nigeria: Anyị ka ga na-eme ngagharịiwe rue na a tọpụ El-Zakzaky- Nwa ya nwaanyị,Nwa El-Zakzaky agbajọọla ọkwa na ndị Shiite akwụsịla ngagharịiwe,"Akụkọ dị mkpa 31/7/19: Sayyida Suhaila sị na ndị Shiite agaghị akwụsị ngagharịiwe ganye na a tọhapụ onye ndu ha Nwa El-Zazaky, onyeisi ndị otu ndị na-ekpe ụka Alakụba a kpọrọ 'Islamic Movement of Nigeria' bụ Suhaila Ibraheem Zakzaky ekwuola na ngagharịiwe otu ahụ ka ga na-aga n'ihu rue na a tọhapụ onye ndu ha. Nke a bụ n'agbanyeghị na ọnụ na-ekwuru otu ahụ ahụ Ibrahim Musa kwuru n'ozi o wepụtara na otu ahụ ga-achịsatụ ọwa na ngaghariiwe ha na-eme iji tie mkpu ka a tọhapụ onye ndụ ha bụ El-Zakzaky e ji eji kemgbe afọ 2015. Musa kwuburu na ịkwụsị ngagharịiwe bụ iji nye ohere ka a kpezie nsogbu ha na gọọmenti etiti nwere. Mana Sayyida Suhaila Zakzaky, onye kwuru nke ya n'ihe onyonyo o wepụtara n' igwe okwu Facebook ụbọchị Tọzde, kwuru na ngagharịiwe ahụ ga na-aga n'ihu rue oge a tọhapụrụ El-Zakzaky. Gọọmentị machiri otu Shia dịka ndị otu ndị oyiegwu maka ngagharịiwe ha mere n'abali olemole gara aga nke tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu onye uweojii na otu onye ntaakụkọ. Ndị ndụ ndị Shiite sị na ha ga-aga ụlọikpe ịgbagha mmachi ahụ gọọmentị machiri ha. Onyeisiala Buhari na ndị eze ọdịnala ọdịda anyanwụ nwere nzukọ n'Abuja taa Onyeisiala Buhari ekwuola na gọọmenti ga na-ezipụ ndị agha na ndị agha ụgbọelu n'okporoụzọ awara awara iji buo agha megide ndị ntọ na ndị ojiegbeezu. O kwukwara na ha nwere ike ịtụ ogbunigwe ebe ndị omekome na-ezo. Buhari kwuru nke a n' ọgbakọ nchekwa ya na ndị eze ọdịnala ndị si Ọdịda Anyanwụ Naijiria nwere n'Abuja ụbọchị Fraide. 3. Ọ sị na ọchịchị ya kpebiri itinye igwe na-ese foto n'okporoụzọ iji gbaa ihe zoro ezo n'anwụ. 4. Buhari kwekwara nkwa iwe ndị uweojii n'ọrụ site na ọkpụrụ ọchịchị niile dị na Naijiria. 5. O kwukwara maka ihiwe ndị ọrụ nche. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla dara iwu ga-ata ahụhụ ma kwe nkwa ichekwa onye ọbụla ebe ọ masịrị ya biri. Nzụkọ Buhari na ndị eze ọdịnala na-abịa dịka mkpu maka ntọ, ori nakwa iwakpo ụmụnwanyị n'ike nke a na-ebo ndị Fulani Ochiehi na-arị elu na mpaghara Ọdịda-Anyanwụ. Ihedioha akwanyerela ụmụakwụkwọ tuuru ugo ugwu Gọvanọ Ihedioha kwere ụmụakwụkwọ abụọ ahụ nkwa agụmakwụkwọ n'efu Ụmụafọ Igbo abụọ, Stephany Ugboaja na Favor Alozie bụ ụmụakwụkwọ kacha mee ọfụma n'ule WAEC nke afọ 2019 n'Imo State enwetela ugwu ruuru ha dịka aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Emeka Ihedioha kwere ha nkwa agụmakwụkwọ n'efu na mahadum ọbụla ha chọrọ. Ha abụọ nwere A1 na 'subject' itoolu ha lere n'ụle ahụ. Ebola ka na-akpakwa ike Obodo Goma dị nsọ na mba Rwanda, Uganda nakwa Burundi. N'ofesi, a na-atụ egwu na ọria Ebola nwere ike igbasa karịa na mba Congo DR dịka ọrịa ahụ gburu onye nke abụọ n' obodo Goma. Ihe ruru mmadụ nde abụọ bi na Goma nke mere ka otu ahụike mbaụwa kwuo na Ebola nwere ike isi mba Congo gafee mba ndị ọzọ n'Afrịka. Ụmụ Afrịka abụọ so bụru ọkacha agba bọọlụ n'ụwa Mohamed Salah (onye Ejypt), Virgil van Dijk na Sadio Mane (onye Senegal) bụcha ndị otu egwu bọọlụ Liverpool nke mba England. N'egwuregwu, otu FIFA ewepụtala aha mmadụ iri nke a ga-esi n'ime ha họpụta otu onye a ga-echi ọkaịbe n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke n'afọ 2019. Ụmụ Afrịka abụọ bụ Sadio Mane na Mohammed Salah so na ndị ewepụtara aha ha, tinyekwara ndị amabu ama dịka Cristiano Ronaldo, Lionel Messi, na Eden Hazard. A bịa na nke ụmụnwanyị, Lucy Bronze na Ellen White nke mba England, nakwa Megan Rapinoe nke mba Amerika so na mmadụ iri a họpụtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Lee ihe nkiri ga-amasị gị: Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ" afirika-55616759,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55616759,Ihe mere ụfọdụ mmadụ enweghị ike ibute nje Coronavirus,Ndị ọkachamara na sayensị na-agba mbọ niile ha nwere ike iji ịchọta ọgwụ eji agwọ ọrịa coronavirus.,"Akụrụngwa a kpọrọ 'T-Cells', dị n'ọbara ụfọdụ mmadụ nwere ike ibuso nje coronavirus agha. Mbọ a ha na-agba amịtala mkpụrụ dịka a chọpụtara ọtụtụ ọgwụ bụ nke nnyocha gosiri na o nwere ike igbochi mmadụ ibute ya bụ ọrịa. Mana dịka a na-agba mbọ niile a, nnyocha miri emi egosila na o nwere ndị na-enweghị ike ibute nje coronavirus. Nke a bụ maka akụrụngwa pụrụ iche nke dị n'ọbara ha, aha akụrụngwa a bụ 'T-Cells'. Gịnị bụ T-Cells? E nwere akụrụngwa dị n'ọbara mmadụ nke na-aluso nje ọbụla batara n'ahụ onye ahụ ọgụ. Akụrụngwa a ka bekee na-akpọ 'white blood cells'. Ọ bụrụ na mmadụ bute nje dị aṅaa dịka 'virus', akụrụngwa a ge-ebuso nje ahụ agha ma matakwa ya bụ nje ka ọ ga-abụ nje ahụ bịakwa ọzọ, ọ gaghị enwe ike ịmetụta onye ahụ ọz. Ọ bụ nke a ka bekee na-ekwu na mmadụ enweela 'immunity' gbasara otu nje maọbụ nke ọzọ. Iji maa atụ, ọrịa 'chicken pox' na-eme mmadụ naanị otu ugboro na ndụ, n'ihi na 'white blood cell' amatala nje na-akpata ọrịa ahụ, ọ gaghị ekwekwa ka nje ahụ metụta onye ahụ ọzọ. Coronavirus explainer: Lekwa ọsịsa gbasara ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ maka ọrịa a. Mana 'T-cells' bụ akụrụngwa pụrụ iche nke nnyocha gosiri na ọ na-ebuso nje coronavirus nakwa ụfọdụ nje ndị ọzọ agha. Nnyocha gosiri na 'T-Cells' nwere ụdị ihe pụrụ iche kpuchiri ha nke a kpọrọ 'proteins' 'T-Cells' dị n'ahụ mmadụ ruru tarị (trillion) kwuru tarị iji buso nje agha ruo ogologo oge. Ndị ọkachamara nyochara ọbara a mịpụtara n'ahụ ọtụtụ mmadụ tupu ọrịa coronavirus amalite, ha wee chọpụta na ụfọdụ ọbara ahụ nwere akụrụngwa 'T-Cells' bụ ndị ọrụ ha bụ ibuso nje dịka coronavirus agha. Coronavirus: Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara ọrịa a Nke a gosiri na ụfọdụ mmadụ enweelarị akụrụngwa ga-egbochi ha ibute nje coronavirus tupu ya bụ ọrịa abanyerị n'ahụ mmadụ. Nnyocha gosiri na mmadụ ruru pasentị iri anọ ruo iri isii (40% to 60%) nwere akụrụngwa 'T-Cells' ndị a n'ahụ ha. Ndị dị otu a nwere ike ibute nje covid mana owneghị ihe ọ ga-adị ha ka. Mana... Oge e nyochara ahụ ụfọdụ mmadụ ndị ọrịa coronavirus mekpara ahụ nke ukwu, a chọpụtara na ahụ ha na-emepụta T-Cells mana ha na-anwụchasị. Ọ gbara ndị nnyocha ahụ gharịị ihe kpatara ụdị ihe ahụ. Adrian Hayday, Ọkammụta 'Immunologu' n'ụlọakwụkwọ 'Kings College' kwuru sị: ""Anyị amachabeghị ihe na-akpata ya bụ T-Cells ji anwụ n'ime ahụ ụfọdụ mmadụ."" ""O doro anyị anya na T-Cells nwere ike inye mmadụ nchekwa ruo ogologo afọ, mana ọ na-adị anyị ka na ọ bụrụ na onye adaala n'ọrịa, T-Cells agaghịkwa enweta onwe ya iji chekwaa onye ahụ.""" afirika-56312395,https://www.bbc.com/igbo/afirika-56312395,"International Women's Day: ""Na mbụ di m ekweghị ka m na-akwọ ụgbọala ọha"" - Amaka Nwobodo",Amaka Nwobodo bụ nwaanyị na-akwọ ụgbọala ọha na Lagos.,Ọ kọrọ BBC etu ya si maliere ịrụ ọrụ a na ihe ọ na-afụ dịka nwaanyị nọ n'etiti ọtụtụ ụmụnwoke akwọ ụgbọala ọha. O jikwa ohere wee gbaa ụmụnwaanyị ume na o nweghị dị njọ n'ịgba mbọ ma gbakarịa ụmụnwoke makana ịbụ nwaanyị abụghị ọghọm kama ọ bụ nnukwu uru. Akụkọ a na-abịa dịka a na-eme ncheta ụmụnwaanyị nke bekee kpọrọ International women's day taa na mba ụwa niile. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-51583156,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51583156,Pete Edochie: Ịga 'honeymoon' na ihe ndị ọzọ a mụtara n'aka ndị ọcha,Ọlụlụ di na nwunye bụ ihe dị oke mkpa na ndụ ndị mmadụ n'agbanyeghi agbụrụ ndị ahụ si.,"Mana agbụrụ ọbụla nwere usoro dị iche iche ha ji eme emume ọlụlụ di na nwunye nke ha. Igbo nwere omenala pụrụiche n'ihe banyere ọlụlụ di na nwunye mana ọ dịka a ga-asị na ha akụrụla ụfọdụ omenala ndị ọcha. Ngwa ka anyị tụlee ụfọdụ omenala ndị ọcha a nke ndị Igbo ṅomiri. Isekpuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ Nke a bụ omenala ọgbara ọhụrụ na-arị ibe ya elu ugbua n'ọlụlụ di na nwunye bụ nke na-adịghị n'ala Igbo n'oge mbụ. O so na omenala ndị e ṅomiri n'aka ndị ọcha nke ọtụtụ ndị ọdịnala Igbo dịka Pete Edochie katọrọla ọtụtụ oge. Pete Edochie hụtara ya dịka nwoke ị gbara nwaanyị ohu. Ọ sị na omenala Igbo anabataghị nwoke isekpuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ. Mana e nwere ọtụtụ mmadụ karịsịa ụmụnwaanyị sị na nwoke isepkuru ala arịọ nwaanyị ọlụlụ gosiri ụdị ịhụnanya o nwere n'ebe nwoke ahụ nọ. Ịgbanye ọla aka Itinye ọla n'aka dịka a na-ahụta ugbua abụghị njirimara ndị Igbo n'ihe banyere alụm di na nwunye. O sokwa n'otu ihe ndị a mụtara n'aka ndị ọcha bụ nke a ga-asị zuru Igbo ọnụ ugbua. N'agbanyeghi na o nwere ụfọdụ ihe Igbo ji egosipụta nwoke maọbụ nwaanyị lụrụla nwunye maọbụ di mana ọ bụghị ịgbanye ọla aka. Ụfọdụ ihe ndị a gụnyere nwaanyị ịma ukwu akwa abụọ, ịgbanye ọla olu nakwa ụfọdụ akara dị iche iche. Ịgba akwụkwọ n'ụlọụka nakwa n'ụlọikpe Ndị a bụ omenala alụm di na nwunye e ji mara ndị ọcha nke ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakwunye n'omenala ha bụ. Omenala nke e ji mara ndị Igbo bụ ịgbankwụ a kpọrọ 'Traditional Marriage' nke gụnyere ịkwụ ụgbọ isi nwaanyị na ihe ndị ọzọ so ya. Ọ bụrụ na a gbaghị nkwụ nwaanyị nke ahụ pụtara na a lụghị nwaanyị ahụ alụ. Mana ụfọdụ ndị ụka Kraịst na-etinyere nke ha ịgba akwụkwọ n'ụlọụka ebe ụfọdụ na-agba akwụkwọ n'ụlọikpe. Emume 'Bachelor's Eve' Nke a bụ emume a na-eme iji nye nwoke okokporo ohere ka o mee ihe ndị ahụ nwunye ya nwereike agaghị anabata ma ọ lụọ ya. Ọ bụ ohere nwoke a na ndị enyi ya nwoke ga-anọkọ ọnụ, rie oriri, ṅụọ mmanya, tee egwu nakwa ihe ndị ọzọ. Nke a esoghi n'omenala Igbo n'ọlụlụ di na nwunye mana ọtụtụ ndị na-emezi ya ugbua. Mana e nwere ndị sị na ọ bụ ụzọ ọzọ e ji atụfu ego n'ọlụlụ di na nwunye. Ezumike 'Honeymoon' Nke a bụ ezumike di na nwunye lụrụ ọhụrụ na-enye onwe ngwa ngwa ha lụchara. Ụfọdụ di na nwunye na-aga ebe dịka ụlọ ndina, ụlọ oriri na nkwari ogogo ha dị elu gụnyere ndị nọ n'ofesi n'oge ezumike a. A bịa n'omenala ọlụlụ di na nwunye n'ala Igbo, onweghi ihe dịka ezumike n'ụdị a akpọrọ 'honeymoon' mana ugbua a na-emezi ya. N'oge mbụ, ọ bụrụ na di na nwunye gbacha nkwụ taa, echi ha abụọ nwereike itinye isi n'ọrụ ugbo bụ ọrụ dị n'oge ahụ. N'agbanyeghi etu omenala ọgbara ọhụrụ ndị a ji arị elu n'ala Igbo, e nwere ndị ka ji omenala Igbo hiwe isi. Ndị a ka na-agbaso omenala e ji mara ndị Igbo n'okwu banyere ọlụlụ di na nwunye, na-etinyeghi ya nnu maọbụ ose. Ihe nkiri ga-amasị gị: Marriage: Ị ga-agwa di maọbụ nwunye gị ego ole ị na-akpata?" 45903046,https://www.bbc.com/igbo/45903046,"Azọputala mmadụ itoolu, mmadụ atọ ka nọ n'ime ala n'ụlọ dara na Nnewi","Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ụlọelu ụlọatọ adaala n'Okpunu Otolo n'ime Nnewi, Anambara steeti.","Ndị ụlọọrụ ntaakụkọ ""TVC News"" dere n'akara twitter ha ndị ụlọọrụ gbatagbata azọọla mmadụ ruru itoolu n'ime ebe a. End of Twitter post, 1 Ha kwukwara na ha ka na-agba mbọ ihu na azọpụtara ndị niile nọ n'ime ala ebe ụlọelu a dara. Komishioner steeti ahụ bụ Garba Baba Umar gwara BBC Igbo na mmadụ atọ ka nọ n'ime ala ugbua. N'ọnụ okwu ya: ""Ụlọelu a dara n'ụzụ ụtụtụ taa bụ ụbọchị 18 n'ime ọnwa Oktoba oge mmadụ ruru 13 na-arụ ọrụ n'elu ya"". O kwukwara na ugbua ụlọọgwụ ahapụla mmadụ asaa n'ime mmadụ itoolu azọpụtara ugbua, mmadụ abụọ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ makana ha gbajiri ụkwụ. O kwuru na ugbua anaghị enwe ike ikwu ma mmadụ atọ ahụ nọ n'ime ala ka dị ndụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị" 42779329,https://www.bbc.com/igbo/42779329,George Weah nwere nnukwu ọrụ ka onyeisi ala Liberia,Ọ bụ eziokwu na George Weah bụ ezigbo onye okwe na egwuregwu bọọlụ mana ndi mmadụ na-eche na ọ ga-agba mbọ.,"George bụ ọgbaa bọọlụ mbụ na Afrika eturu ugo dika 'Fifa World player of the year' Ịhụ na atumanya ndi Liberia n'ebe ọnọ a bughị na nkiti. Mgbe Onye ọrụ BBC akpọrọ Fergal Keane gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ebum n'obi ya gbasara nnukwu atụmanya chere ya n'ihụ, o kwuru na enyemaka na nkwado ndi Liberia ga-eme ka o me ọfụma dika onye isi ala ọchịchị obodo ahụ. Sitere n'ịgba bọọlu bụrụ onyeisi ala Liberia Nke a bụ oge mbụ n'ime afọ iri na asaa ana-enwe mgbanwe ọchịchị n'udo. Kedụ ihe ndi mmadụ na-ekwu Otu nwoke akpóró Joseph Duo bụ onye agha mgbe di na nwata siri na George Weah bụ olileanya ndị Liberia nwere iji were gbanwe ọnọdụ ha. George abatala ọchịchị ma kwekwa nkwa na ya ga-kpochapụ mmerụ aka, dozie agụma akwụkwọ na nlekọta ahụ ike ma wetara ọtụtụ ndị Liberia puku na puku ọrụ. O sị na ọ ga-agba mbọ hụ na omezuru mkwa nille a maka ihunanya ndị Liberia nwere na ebe ọ nọ. Ihe ise maka George Weah:" afirika-45302552,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45302552,Ndị ogbuaraọbara gburu nwoke n'okpuru ọchịchị Nwangele,"Egwu bara ndị mmadụ ahụ ụnyaahụ n'Amaigbo, nke dị na okpuru ochịchị Nwagele dị n'Imo steeti mgbe ndị ogbuaraobara ji ụgbọala egbagbụrụ otu nwoke were gbafere ọsọ.","Ndi omekome egbuala otu onye n'Imo steeti ma tọrọkwa ndị ọzọ Nwoke aha ya bụ Theo Mbakwe kwụ n'ihu be ha mgbe ndị omekome a gbakaranyere ya egbe n'ụbọchị satọde. Otu onye BBC kpọrọ bụ onye Amaigbo bụ Duke Olueze Ukaeje kwuru na ya bụ ihe menyere onye ọbụla ụjọ n'ahụ ebe ahụ. Ukeje kwuru na onweghị onye maara ndị kpara ike a ka ọ dị ugbua ma kwukwa na nna Theo Mbakwe anọghịzị ndụ. Ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii n'Imo steeti bụ Andrew Enwerem kwukwara na nke a bụ eziokwu sikwa na ndị uweoji bugara ya bụ nwaamadị ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta nọ kwuo na ọ hapụla. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii amabeghị ndị kpara ike a, mana ha ka na-etinye anya na ya. Ịtọ mmadụ bụ nnukwu nsogbu na Naịjirịa. Ndị ntọ kpara ike n'Owere Nkwoji Ka a na-ekwu nke a, n'otu ụbọchị ahụ, ndị Owere Nkwọji dị n'okpuruọchịchị Nkwere kwara ndị ntọ ọbịa bụ ebe ha nọ tọrọ otu nwoke na enyị ya nwaanyị, dị ka Enwerem gwara BBC. Ndị ntọ a tọọrọ nwoke a na enyị ya nwaanyị na ụgbọala ha. Dịka osi kwuo, ""ndị ntọ a gbahapụrụ ya bụ ụgbọala n'Amuizu n'okpuruọchịchị Nkwere ebe ndị uweojii na-achụ ha ọsọ"". Enwerem sị na ndị ntọ ahụ buru ndị ha jị tinye n'ụgbọala Hilux ọzọ ha natara mmadụ were gbafuo. Mana ka ọ dị ugbua, ọ sịkwa na ha jị teknụzụ na ama imi n'ala ịchọta ebe ndị omekome ahụ buru ndị ahụ gawa. Ọ gbakwara ama na ha enyopuola ebe ha nọ kama na ha na ebereebere tupụ ha jugbuo ka ha ghara imeru ndị ha ji ahụ. Akụkọ ga-amasị gị Gọọmenti etiti ji ọrụ dị 69 n'aka n'Ọwụwa-Anyanwụ BIM chọrọ ka Ndigbo kwụwa ụtụisi n'aka ha Ụmụnwaanyị Ipob: Buhari na-achọ nnukwu okwu" afirika-47432170,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47432170,Kamaru Usman: Nwaafọ Naịjirịa tụrụ ugo n'egwuregwu mgba UFC,"Kamaru Usman bụ onye eji ""Nigerian Nightmare"" mara abala na-akwụkwọ dịka onye mbụ si Afrịka tụrụ ugo ka dịke n'egwuruegwu mgba UFC.","Usman, bụ nwaafọ Naịjirịa, meriri nwaafọ Amerịka aha ya bụ Tyron Woodley na mgba nke ogige ""Welterwaight"". Ndị chịkọrọ ya bụ mgba sị na Usman ji ọnụ ọgụgụ 50-44, 50-44 and 50-45 mekarịa Woodley bụ onye ji bụ ugo a. End of Twitter post, 1 Ekele na-awụrụ Usman maka mmerị a. Usman ga-ezụte Colby Covington iji mara ma o ga-ejidenwu ugo a ọ tụrụ mana ekwubeghị mgbe ọ ga-abụ. Woodley n'onwe ya n'ekele Usman makana ọ sị na ọ gbara mgba ọfụma iji nweta mmeri a, mana ọ sịkwa na ya chọrọ ka ha gbagharịa ya bụ mgba. Ọdịda Woodley dara n'aka Usman bụ mbụ o nwetere kamgbe ọ banyere n'egwuregwu mgba UFC. Usman n'onwe ya a gbala mgba ugboro iri na isii, ma daa naanị otu ugbo." mba-uba-45213225,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-45213225,"Aretha Franklin tiri ""Respect"" anwụọla n'afọ 76",Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na otiegwu a ma ama bụ Aretha Franklin anwụọla.,"Franklin bụ onye a ma maka egwu ndị dịka ""Respect"" nakwa ""Natural Woman"" gbara afọ 76 tupu ọ nwụọ. Ọ bụkwa nwaanyị mbụ e debanyere aha ya na ndị na-eti egwu 'Rock and Roll' a na-agaghị echefu echefu, nke Bekee kpọrọ 'Hall of Fame'. Franklin bụ nwa ụkọchukwu ndị Baptist si obodo Detroit, ji ịgụ egwu ụka bido ma gaa n'ihu gụọ ọtụtụ egwu e ji mara ya. Oge ọ dị ka kpakpando ya n'ịgụ egwu adịghị anwuke, o tigharịrị egwu Otis Redding bụ 'Respect', tinyekwuo ya egwu nke ya, mere ka kpakpando ya nwusie ike. Franklin gụgharịrị egwu ahụ na-ekwu maka nwoke na-arịọ nwunye ya kwanyere ya ugwu ka o were ego kwụọ ya ụgwọ, gụọ nke ya ka ọ bụrụ nwaanyị na-anaghị arịọ biko; kama ọ na-ana naanị oke ruru ya. Egwu o tiri bụ 'R-E-S-P-E-C-T' abụghị njirimara ndị 'feminist' nakwa nke ndị chọrọ ka ndị mmadụ nweta ikike ruru ha na mba Amerịka, ruo mgbe Aretha Franklin mere ya ka ọ bụrụ njirimara ha Akwụkwọ ozi Rolling Stone kpọrọ egwu ahụ otu n'ime egwu ise kacha mma kamgbe isi mbido ụwa. Ha kwuru: ""Enweghị ihe Franklin na-ana. Ọ gụrụ egwu ahụ site n'ebe dị elu; nwaanyị na-akpọ oku ka a kwụsị ikpaso ụmụnwaanyị oke maka na ha bụ nwaanyị."" Nwaanyị mkpụrụobi Egwu ahụ ọ gụrụ metụtara ndị mba ahụ niile, oge ebe niile tachiri atachi ka ọtụtụ niime ha na-azọ ikike ruru ha ebe afọ 1960. Ndị isi ojii Amerịka hụtara egwu ahụ ka nkwudo megide mkpagbu nakwa inye nwaanyị ikike. Aretha Franklin kwuru: ""E cheghị m na egwu m ga-emecha bụrụ abụ nye ụmụnwaanyị. Mana ọ na-atọ m ụtọ"" ""Respect"" bụ otu n'ime egwu ndị Franklin gụrụ ga-adịgide ndụ. Ndị ọzọ o tiri oge ahụ gụnyere ""I Say a Little Prayer"" ọ gụrụ n'afọ 1968 nakwa ""(You Make Me Feel Like) A Natural Woman"" ọ gụrụ n'afọ 1967. 'Ọrụ dị gara gara' Aretha Franklin mere ka anyammiri pụọ Barack Obama bụbu onyeisiala mba Amerịka n'anya oge ọ na-agụ egwu Ọ gụrụ ọtụtụ egwu ruru isi mbido 20 n'ọgbọ 'ndị kacha agụ egwu' nke Amerịka, n'ime afọ 70. O nwetara ihe nrite Grammy maka onye kacha egosipụta egwu R&B ugboro asatọ so ibe ya, site n'afọ 1968 ruo 1975. Onyeisiala George W Bush nyere ya ọla nnwereonwe nke ndịisiala na-enye, n'afọ 2005. Ọ lara ezumike nka n'afọ 2017, na-ekwu na ahụ na-eme ya ""gara gara"" maka ịkwụsị ịgụ egwụ. N'ime ndụ ya, ọ rịara ọrịa ọtụtụ oge, site n'ụlọọgwụ fere n'ụlọọgwụ." afirika-44267646,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44267646,Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob sị onye apụla na 30 Mee,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ipob amalitela izisa ozi maka Mee 30,"30 Mee 1967 bụ ụbọchị agha Biafra na Naịjirịa bidoro Ndị IPOB amachiela ọrụ ma ọbụ ahịa ubọchị 30 Mee afọ a. Otu ahụ na-akpọkụ oru na Igbo ka ha tukwuru n'ụlọ maka ncheta ndị egburu na agha nakwa ndị egburu kemegbe gbanụgbanụ mnwere onwe Biafra bidoro. Ọkụ na-agba ebe ana-amịpụta mmanụ agbidi na Yenegua Depthwize bụ ụlọọrụ n'egwuputa mmanụ agbidi nke ọtụtụ ndị nwe ya bụ Naịjirịa na ndị mba ọzọ Oke ọkụ na agba n'ebe ana-egwuputa mmanu agbidi n'ime oshimiri dị na Yenegua taa, dịka ụlọọrụ Reuters kwuru. Ndị akaebe hụrụ ya bụ ọkụ sị na ya bụ ọdọmmanụ nke ndị Depthwize nwe ka na-agba ọkụ ruo n'ehihihi a. Ka ọdị ụgbụa, ndị ụlọọrụ ahụ ekwubeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ. Akụkọ mba ofesi Iwu a ga-eme ka nwaanyị nwee ike ịnata ikike maka iwepu afọime rugoro izuuka iri na abou (12). Na mba ofesi, mba Ireland ekwekọrịtala na nwaanyị nwere ikike itepu afọime ọchọghị. Mba ahụ mere ntuliaka ebe mmadụ persenti iri isii na asatọ (68%) nọ kpebie na ha achọghịzị ya bụ iwu nke megidere nwaanyị itepu afọime. Ana atụ anya n'iwu a ga-amalite ịdị ire na ngwucha afọ a. N'egwuregwu; Real Madrid na Liverpool ga-akwata n'abalị a Asọmmpị a ga-abụ na ọgbọegwu bọlụ Kiev Olympic na Ukraine , Real Madrid na Liverpool ga akwarịta mpị na ekwucha ọgwụ nke Champion league taa. Ya bụ asọmpi ga-amalite na mgbede a ma ọfọdụ nkejị iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ (7:15). Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Etu anyi siri nwuchie nwoke gburu nwunye ya maka ekworo'" afirika-44032246,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44032246,Ndịagha ekwuola na ha gbapụtara mmadụ ruru 1000 Boko Haram nwụchiri,Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha zọpụtara mmadụ karịrị otu puku n'aka ndịagha Boko Haram.,"Ndịagha Naịjirịa kwuru na ọ bụ ndị na-alụ ọgụ Operation Lafiya Dole gbapụtara ndị a Ha kwuru na ha si n'obodo dị iche iche n'ime Boma dị na Borno steeti zọpụta ha. Ndị a gbapụtara gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka nakwa ụmụokorobia ndị kwuru na a magidere ha ịlụ agha Boko Haram. N'ihe ha depụtara na Twitter, ha kwuru na enwere ndị ọzọ tinyeere ha aka, iji gbapụta ndị a. N'agbanyeghị na ha kwuru na ha agbapụtala ndị eji eji, ha ewepụtaghị foto ọbụla iji gosi ndị ahụ ha gbapụtara. Nke a bụ ugboro atọ n'ime ọnwa anọ ndị agha na-ekwu na ha gbapụtara ndị mmadụ n'aka ndị Boko Haram. Ihe ndị ọzọ ha depụtara: Mgbapụta ndị a akwụsịghị ndị Boko Haram ịkpa mkpa mkpa ha na-akpa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49511878,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49511878,"Catholic priest killing: E gbuola ụkọchụkwụ Katọlik ọzọ, gbaa ozu ya ọkụ",Ndị uweojii Taraba steeti kwuru na ha na-eme nnyocha iji nwụchie ndị gburu ụkọchụkwụ ma gbaa ozu ya ọkụ na Taraba steeti.,"Ndị uweojii: Anyị na-achọ ndị gburu Fada, gbaa ya ọkụ Akụkọ kwuru na ndị a mabeghị ndị ha bụ gburu Fada David Tanko nke ụlọụka St.Peters Catholic Church, Amodu, dị n'okpuru ọchịchị Takum, Taraba steeti, oge ya na ndị ogbo ya na-aga maka mkpezi ikpe dị n'etiti ndị Jukun na ndị Tiv ụbọchị Fraide n'ime obodo Kpankufu n'ụzọ Wukari. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Taraba bụ David Misal, gwara BBC Igbo na ya bụ ọdachi mere n'ezie. End of Twitter post, 1 Ọ gara n'ihu kwuo, ""Anyị na-esi imi n'ala inweta ndị kpara mkpamkpa ahụ."" Ka ọdị ugbua, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Adamu Mohammed enyela kọmishọna uweojii Taraba iwu ịchọta ndị mere ya bu ihe. O nyekwara ndị kọmịshọna ndị uweojii nọgasị na steeti dị icheiche iwu ilebanye pụụ iche na nchekwa ndị ụkọchukwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51492067,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51492067,Imo state: Ụlọikpe ukwu ekwetala itinye anya n'ikpe ntuliaka gọvanọ Imo steeti,Nke kpọtụrụ ụmụibe bụ na Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekwetala ilebanye anya na mkpebi ha nyere maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti.,"Anyị nụrụ na ya bụ ụlọikpe etinyela ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Febuwarị maka ilebanye ya bụ ikpe anya. Nwoke mabara mmiri na 3rd Mainland Bridge A rụrụ akwa mmiri 'Thirdmainland' na 1990 n'ọchịchị Ibrahim Babangida Akụkọ na-eru anyi ntị bụ na otu nwoke amakpuola na akwa mmiri nke atọ na Legọs gbuo onwe ya. Akụkọ na-akọwa na ya bụ nwoke amatabeghị onye ọ bụ pụtara n'ụgbọ ala ya maba mmiri. Ndị ọrụ mgbatagbata na-achọ ya bụ nwoke ka ọ dị ugbua. Coronavirus egbuola mmadụ n'Irop Otu onye bụ onye Chaịna anwụọla n'aka ọrịa Coronavirus na France. Minista ahụike nke France bụ Agnès Buzyn kwuputara nke a ụbọchị Satọde. Nke a bụ onye mbụ nwụru na Europe kemgbe ya bụ ọrịa malitere ịkpa mkpa mkpa. Norwich na Liverpool na-akwata N'egwuregwu, Liverpool na Norwich bụ ndị nke mbụ na ndị nke ikpeazụ na okpokoro Premier league na-ezute ugbua. Norwich emerunbeghị Liverpool na ụgbọrọ iri na atọ ha gbagoro bọọlụ ebe Liverpool merigoro ha ugboro isii. Oluwo nke Iwo bụ Abdulrasheed Adewale Akanbi agbarala isi onwe ya n'okwu gbasa ọgụ a sị dara n'etiti ya na Agbowu nke Ọgbaagbaa bụ Sikirulahi Akinropo. N'okwu ya, ọ sị na ọgbaghara a dapụtara n'ihi na Agbowu kpọrọ ya ""onye ara"" ma chọọ igwunye ya ọfọ ya n'anya. Oluwo (bụ eze ndị obodo Iwo) kwuru na ha zara oku ndị uweojii kpọrọ ha ikpe udo maka oke ire ala ndị isi obodo ya na nke Agbowo na-ere ma na-azọ, mana Agbowo malitere ịkparị ya ma chọkwaa ịrụkpọ ya anya. Oluwo kwuru na ọ bụ okwu ịgbata ala ndị eze nọ ya n'okpuru nke Agbowo so n'ime ya na-erefusi, butere okwu ọgụ na mgba a mere ka ọ na-agọrọ ọnụ ya. Lee ihe ndị o kwuru n'elu Instagram ya: A tọrọla onye ụkọchukwu ọzọ na Naịjirịa Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ntọrị mmadụ atọrọla Fada Nicholas Oboh bụ otu ụkọchukwu na-arụ n'Uromi dayọsis n'Edo steeti. Fada Oseabulu Odenore bụ onye na-achịkọta dayọsis ahụ dere na Facebook sị na ha ma na ọ ka dị ndụ dịka ha na-agba mbọ ịhụ na a tọghapụrụ ya na-enweghị nsogbu ọbụla, ma sị ndị mmadụ tinyekwa ọnọdụ ahụ n'ekpere. Dịka ha si kwuputa, a tọrọla ụkọchukwu a n'ụbọchị Valentine bụ 14 nke ọnwa Febrụwarị. Nke a na-abịa dịka elichara otu n'ime mmadụ anọ na-agụ akwụkwọ Fada ndị ntọ nwụchiri na Kaduna. Ka anyị jikọọ aka ọnụ na Bayelsa Gọvanọ ọhụrụ nke Bayelsa steeti bụ Douye Diri akpọkuola onye ọbụla ka ha jikọọ aka ọnụ wee dozie steeti ha n'agbanyeghi pati onye nọ. Aka chịburu Bayelsa nakwa Naịjiria bụ Goodluck Jonathan kwukwara otu ihe ahụ ma tinyekwa ọnụ ịgwa Diri na ọ na-atụ anya na ọ ga-eme ọfụma n'oche ahụ. Ọrịa Covid-19 atụọla ụkwụ n'Afrịka Ihe karịrị mmadụ 63,000 bu ọrịa coronavirus a na Chaịna Ngalaba World Health Organization (WHO) ekwuola na ha ga-enyere Ijipt aka ibuso ọrịa Coronavirus a na-akpọ Covid-19 agha dịka ha kwuputara na otu onye ebutela ọrịa a na mba ha. N'otu aka ahụ, obodo Beijing dị na mba Chaịna enyela iwu si onye ọbụla na-alọghachite n'obodo kpọchie onwe ha maka nnyocha ọrịa coronavirus n'izu abụọ tupu ha agagharịwakwa. Chelsea a ga-azụ Isco? Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Chelsea na Arsenal na-achọ etu ha ga-esi gote Isco n'aka ndị Real Madrid. Ebe Jose Mourinho na-achịkọta otu Tottenham na-ekwu na ha 'na-esi' nrigote n'ọkwa ịbụ ndị nke anọ na tebulu mgbe Premier League afọ a ga-agwụ. Gịnị na-eme na Bayelsa steeti? Ndị uweojii Bayelsa steeti amachiela ndị mmadụ ịgagharị na steeti ahụ site n'abalị ruo n'isi ụtụtụ, dịka ọgbaghara dapụtachara ebe ahụ. Uche Anozia bụ kọmishọna uweojii steeti ahụ kwuputara nke a tupu e duo Duoye Diri n'iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ nke steeti ahụ. N'ofesi, Ihe ruru mmadụ iri atọ gụnyere ndịagha itoolu anwụọla dịka ndị omekome wakporo mpaghara atọ na mba Malị. Enwebeghi ndị kwenyere na ọ bụ ha bu mwakpo a n'isi, mana Aly Ousmane Barry bụ igwe otu obodo a wakporo kwuru na mwakpo a suru na-erughi awa ole ndịagha gọọmentị kwarala ngwongwo ha pụọ n'obodo ahụ. N'egwuregwu, A machiela otu egwuregwu Manchester City maka isonye n'asọmpi nke Yurop n'afọ 2020/21 ruo 2021/22 maka imebi iwu otu jikọrọ otu egwuregwu niile nke Uefa. Iwu ndị ahụ gbasara akwụkwọ ikike ha nakwa usoro mkpata na mmefu ego nke ndị otu a. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A machiela Manchester City n'egwuregwu nke Uefa Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko" afirika-48735839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48735839,Nollywood Movies: Ka e si emepụta ejije Igbo,Ị ma etu e si emepụta ejije ndị ị na-ele n'onyonyo gị?,"BBC Igbo gara soro ndị na-eme ejije Igbo hụ etu ha si emepụta ndị na-amasị gị. ""Director"" na-ahụ maka nhazi usoro e si eme ejije, kọwara ihe ha na-agabiga ịchịkwa ndị na-eme ejije. Onye ""producer"" bụ onye nwe mmepụta ejije, kwukwara etu ego e si emepụta ejije na-esi abanye ha n'aka. Lee ihe nkiri a ka ị jiri anya gị hụrụ. Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53683898,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53683898,Edo state Assembly: E mechiela ụlọomeiwu Edo steeti dịka a malịtere ịrụgharị ya,Mba Amerịka akatọọla ihe na-eme n'Edo steeti dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akụkọ isi dịka ntuliaka gọvanọ na-abịa nso na steeti ahụ.,"N'ozi ha wepụtar n'akara Twitter ha ụbọchị Fraide, ha kwuru na ""Akụkọ na-apụta etu ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Edo steeti si akawanye njọ nakwa ihe ndị o metụtara na-eme adịghị anyị obi mma."" ""Nke kachasị njọ bụ ebubo na ndị ọrụ nchekwa na-etinye sị aka ha n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị."" End of Twitter post, 1 Kemgbe abalị ole na ole gara aga, Edo steeti dịka ebe a na-eme iihe ejije dịka abụọ kachasị ewu ewu na steeti ahụ bụ PDP na APC na-azọ aka ka aka. Onyeisiala Muhammadụ Buhari nọrọ n'obi gọọmenti dị n'Abuja ụbọchị Fraide Muhammadu Buhari dọnyere Osagie Ize-Iyamu ukwu dịka onye ga-efeere APC ọkọlọtọ na ntuliaka gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị 19 nke ọnwa Septemba. Godwin Obaseki eboola Hope Uzodinma, Oshiomole ebubo atụmatụ ikposa ọchịchị ya Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki nyere iwu n'ụbọchị Tọzde ka e wepu elu ụlọomeiwu nke steeti ahụ iji gbochi ndị omeiwu ịnwe nzụkọ ha. Nke a na-abịa dịka ya na ndị uweojii gbochiburu ụzọ ụlọomeiwu ahụ kwatara ya n'ụtụtụ ụbọchị taa bụ Tọzde. Ọ chụrụ ndị uweojii ahụ ọsọ ụkwụ eru ala tupu o nye iwu ka ewepu elu ụlọ ahụ dị n'isiobodo steeti ahụ bụ Benin. Obaseki onye kọwaara BBC sitere n'olu ọnụ na-ekwuru ya bụ Crusoe Osagie na ihe a mere bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa gọvanọ otu steeti na-anwa ibute ọgbaghara na steeti ya dịka a na-akwado ịme ntuliaka steeti ahụ n'ọnwa Sepụtemba. ""Ọ bụ Adams Oshiomhole na ndị otu APC gụnyere Hope Uzodimma chọrọ iji ike weghara ụlọomeiwu steeti ahụ"" Cheta na APC họpụtara Hope Uzodimma dịka onyeisi otu ọ dịrị ịchụrụ Ize-Iyamu vootu na ntụlịaka ọkwa gọvanọ na-abịa. ""Anyị nụrụ na ha gara kpụọ 'Mace' adịgboroja jiri ya wakpo ụlọomeiwu (nke a na-arụgharị ugbua) iji kpokọba ụlọomeiwu ọzọ n'ụtụtụ Tọzde."" O kwuru na obi adịghị ya mma na ọ bụ ndị okenye kwesiri ị na-ekpokata ndị mmadụ na-achọ ibute ọnọdụ ọgbaghara. O jikwa ohere ahụ kpọọ oku ka Onyeisiala Buhari nakwa ndị ọrụ nchekwa dị icheiche bịa tinye ọnụ n'okwu a. Cheta na ọ bụ ụnyaahụ bụ Wernezde ka ndị ụlọomeiwu chụturu osote onyeisi ụlọomeiwu Yekini Idiaye ahụ n'ọkwa ma dochie ya. Nke a mere dịka Idiaye du ndị omeiwu anọ gaa nleta Ize-Iyamu na bee ya iji gosi na ha kwụnyere ya na ntuliaka na-abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 42900093,https://www.bbc.com/igbo/42900093,Sịnetị: Bịa gwa anyị ihe mere na Benue Steeti,Ndị ụlọ omeiwu Sịnetị akpọla onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ.,"Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye-kwuo-uche-ya A gwara Idris ka ọ wuchịe n'ihu Kọmitti na-ahụ maka ihe gbasara ndị uweojii n'ụbọchị taa bịa kọwa ihe mere ojiri nupuisi na mkpebi ndị ụlọ ọmeiwu mere nke sịrị ya nwuchie ndị ọchị ehị ma kpụpụ ha ụlọikpee. Ndị kọmitti a ga-akọwara ndị Sịnetị ihe ha kwupụtara n'abalị isii n'ọnwa febụrụwarị ka ihe ụzọ enwere ike ime gbasara ọnọdụ ahụ. Cheta na ndị ụlọ ome iwu Sịnetị n'ọnwa jenụwarị nyere onyeisi ndị uweojii ịzụka abụọ maka ịchọpụta ma nwechie ndị na-achị ehị a na-enyoenyo nke gụrụ n'abalị abụọ gara-aga Sịnetọ Joshua Lidani nke Gombe Steeti chetara ndị Sịnetị maka ọgwụgwụ oge ahụ enyere onyeisi ndị uweojii, kwuo ka a gwa Idris ka ọ wụchie n'ihu ha. Onye onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki gosipụtara iwe ya n'ebe onyeisi ndị uweojii nọ, wee gwa ndị kọmitti na-ahụ maka ndị uweojii ka ha kpọ onyeisi ndị uweojii ka ọ wụchịe n'ihu ha. Saraki kwuru, ""Anyị ga-eme ka odo ndị nchekwa anya na ọkwa ndị Sịnetị nyere ndị nchekwa obodo abụghị ihe a na-eleda anya."" ""Ndị Sịneti agaghị agba nkịtị ka ihe na-emebi n'obodo.""" afirika-47730115,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47730115,"Nnamdi Kanu: Ọ kaa gọọmenti obi, ha gaa nwụchie Kanu n'ala nsọ - Ụkọchukwu Peace",Ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Peace Chukwudi ekwuola na ihe mere mba Naịjirịa ji chọọ inwụchi onye ndu Ipob bụ makana ndị ọchịchị na-eme ihe masịrị ha n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.,"O kwukwara na ndị ọchịchị Naịjirịa kwesiri ijụ ihe mere ndị agha Naịjiria ji wakpo be Nnamdi n'Afaraukwu dị n'Abia steeti. Ụkọchukwu Peace kwuru na ha na-ele anya ka ha hụ ka ndị ọchịchị ga-esi ga nwuchie Nnamdi Kanu n'ala Israel. Cheta na ihe mere ụlọikpe ukwu dị n'Abuja jiri nye iwu ka anwụchigharịa onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bụ maka abịaghị ụlọikpe ugboro ugboro. Jọstịs Binta Nyako bụ onye nyere mkpebi a n'ụbọchị Tọzde. A tohapụburu Kanu na mkpọrọ n'afọ 2017. A chọwara ya achọwa dịka ndịagha gbachara 'Egwu Eke' nke abụọ n'Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria. Nnamdi Kanu na BBC Igbo Mana o mechara, pụta ife na mba Israel onwa ole na ole gara aga ebe ọ nọọ gbasara ndị na-eso ya ozi. Na mkparịtaụka ya na BBC nwere ọnwa ole na ole gara aga, kanu kwuru na o nweghị ihe ya mere ndị agha jiri wakpoo ụlọ nna ya n'Umuahia oge 'Egwu Eke'. ""O nweghị ụzọ ọbụla m siri mejọọ ha, o nweghị iwu ọbụla m dara."" ""Na m sị ụlọikpe pụta ha sị na m agaghị ekwu okwu, na m agaghị agagharị kele ndị mmadụ."" Akụkọ ka na-abịa 'Ịmachị Ipob dịka otu na-eyi ndụ egwu, hapụ Miyetti Allah adabaghị' Otu jịkọrọ ndị na-ede edemede banyere ikike dịrị onye nke a kpọrọ 'Human Rights Writers Association of Nigeria( HURIWA)' adụọla onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ka ọ kwụsị ịkpa oke n'ọchịchị ya site na ịmaghapụ mmachi a machiri otu Ipob. HURIWA akpọrọ onyeisiala Buhari oku ka ọ kwụsị atụmatụ ikpa oke n'ọchịchị ya ma nye mpaghara ọbụla oke ruru ha n' ịhọpụta ndị ọ ga-etinye n'ọkwa n'agba nke abụọ nke ọchịchị ya. Huriwa kwuru na gọọment machiri ndị Ipob ndị ebughị egbe maọbụ ngwaagha ọbụla azọ nnwereonwe Biafra , ma hapụ ndị ọchịehi ndị gburuola ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụnwaanyị na na ndị okenye. n'Etiti-Ugwu Naijiria ha na-akpa ike na enweghị ntaramahụhụ ọbụla. Ha katọkwara Buhari maka ịkpa oke na ndị o nyere ọkwa n'ọchịchị ya. N'ozi nke onyeisi mgbasaozi ha bụ Emmanuel Onwubikoe wepụtara, Huriwakatọrọ ogbugbu e gburu ndị otu Ipob oge ha mere ngagharịiwe na Onicha, Aba nakwa ụmụahịa tupu nakwa oge 'Egwu Eke' agba nke abụọ na agbanyeghị na o nweghị ngwaọgụ ha ji, ebe n 'aka nke ọzọ, ha na ndị ọchịehi na-enwe mkparịta ụbụbọ. Huriwa kwuru na gọọmenti banyere ndị agha kpara mkpamkpa aja n'ukwu site n'ịgba ha nkịtị. Cheta na gọọmenti etiti machiri otu Indigenous People of Biafra nke a kpọọ Ipob n'aha ịchafụ n'afọ 2017 site ozi onyeisi mgbasa ozi ndị ọrụ nchekwa bụ Major John Eneche wepụtara nke boro Ipob ebubo ""ihiwe ndị ọrụ nchekwa nzuzo,(Biafra Secret Service), ịnọchi okporoụzọ nakwa ị na- anapụ ndị mmadụ ego.' Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43313107,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43313107,Atọhapụla onye ntaakụkọ ndị DSS ji ka abali asaa gara,Ngalaba nzuzo na-ahụ maka nchekwa nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ atọhapula Tony Ezimakor bụ onye ntaakụkọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ntaakụkọ Daily Independent.,"Atọhapụrụ Ezimakor ka abalị asaa gara n'ihu ka ndị mmadụ na-enye ezigbo nsogbu ịhụ na gọọmentị tọhapụrụ ya. Anwụchiri Ezimakor bụ onyeisi Daily Indpendent n'Abuja maka akụkọ ha dere banyere ụgwọ gọọmentị Naịjirịa kwụrụ iji hụ na Boko Haram tọhapụrụ ụmụ Chibok ha ji. A kpọrọ akụkọ ahụ ''Chibok Girls: How Swiss-Mediated Deal Revived Boko Haram''. Akụkọ sị na ndị DSS gara n'ụlọ Ezimakor, buru ihe ole na ole wee pụọ. DSS nwụchiri Tony Ezimakor n'ihi na ụlọakụkọ nke oso n'isi ya dere akụkọ gbasara ego gọọmenti etiti mefuru maka ụmụagbọghọ Chibok Ọ bụ abalị asaa ka ha ji onye ntaakụkọ a, mana ka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ikike onye-kwuo-uche ya kwanyere gọọmenti ọkụ n'ike, ha tọhapụrụ maazị a. Ọ dị ka onwere ndi nọ n'ọchịchị ihe a Daily Independent dere na-ewe iwe, ọkachasị etu o siri pụta ka a ka nọ na-ekwu maka ụmụakwụkwọ atọọrọ na Dapchi, nke dị na Yobe steeti. Ndị a ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ikike kwuru na ha ga-aga ngagharị iwe na Wednesday, bụ taa, ma ọ bụrụ na-atọhapụrụ nwoke a. Oruola ndị ntaakụkọ 20 anwụchiri kamgbe 2015 Buhari rigoro n'oche ka onyeisiala Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48844139,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48844139,UK Home office akpaliela iwe ụmụ Naijiria n'okwu ịgba akwụna,Ụmụ mmadụ awụọla UK Home office ọnụ maka ikwu na ụmụagbọghọ e si Naịjirịa gbaa mgbere kpọga ofesi na-alọghachi n'ala ha dịka 'ọgaranya a na-akwanyere 'ugwu.',"Ụlọọrụ ahụ kwuru n'akwụkwọ ntuziaka ha na ""Ụmụnwaanyị atụgara mgbere na Yurop' na-aba ọgaranya site n'ọrụ akwụna. Kwuo kwa na ha bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu, na-enweghi ndị na-eleda ha anya n'ihi na ha a kpatala ego."" Ya bụ okwu kusuru ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụ Naịjirịa nọ na mba Briten bụ ndị tụnyere ọnụ n'okwu ahụ. Child Trafficking: 'Mgbe a gwara m na m bụ nje HIV ekwetaghị m' Ozoemena Nonso Eze kwuru na ịgbe mgbere ụmụnwaanyị kpọga ala bekee bụ 'ịgba ohu nke agba ọhụrụ.' Na nkọwa ya, Eze kwuru na ọtụtụ ụmụagbọghọ ndị a na-anọ n'ahụhụ afọ 10 rue 15 iji kwụọ ndị kpọtara ha alabekee ụgwọ. ""O nweghi ego ọbụla ha na-akpata kama ọ bụ ndị ji ha agba mgbere na-enwe ego."" Sarah Champion sị na okwu ahụ adabaghị. Kate Osamor bụ onye omeiwu na mba UK sị na Home Office amagheghi ahụhụ ụmụagbọghọ ahụ na-ata wee kwuo ụdị okwu ahụ. Mana otu ọnụ na-ekwuru 'Home Office' kwuru na ha ga-elebanye okwu ahụ anya iji degharịa ya.' Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44106502,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44106502,Ndị uweojii: Anyị akpachighị ndị Jew n'ụlọ Nnamdi Kanu,"Dịka akụkọ na-ekwu na ndị uweojii nwụchiri ndị okpukperechi Jew n'ụlọ Nnamdị Kanu, Osote onyeisi ndị uweojii nke Zone 9 Umuahia bụ Karma Hassan ekwuola na onweghi ndị okpukperechi ọbụla ha nwụchiri.","Nnamdi Kanu onye ndu ndị Ipob so n'otu n'ime ndị okpukperechi Jew Akụkọ kwụrụ na ndị uweojii kpachiri ndị okpukperechi Juu dị iri abụọ na otu n'ụlọ onye ndu ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu dị na Isiama Afaraukwu Umuahia, ụbọchị . Odeeakwụkwọ mgbasaozi ndị Ipob bụ Emma Powerful gwara BBC na ndị jew ndị a na-anata ahụhụ ugbua na ngalaba ndị uweojii abụọ bụ CID na Zone 9 dị n'Umuahia. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mgbe BBC Igbo gbara Powerful ajụjụ, o kwuru na ihe ndị uweojii mere ezighị ezi na onweghi ebe edere ya n'iwu ka ndị mmadụ ghara ikpere chi ha. O kwuru na ọ bụghị ihe ọjọọ mmadụ ị ga n'ụlọ Nnamdi Kanu ma ọ bụ ịkpọku aha ya n'ebe ọbụla. BBC Igbo gara n'ihu ịgba osote onyeisi ndị uweojii nke Zone 9 Umuahia bụ Karma H. Hassan ajụjụ, o kwuru na onweghi ndị okpukperechi Jew ụlọọrụ ya nwụchiri. Hassan kwuru na onweghi etu esi anwụchi ndị mmadụ n'ụlọọrụ ya nke na ọ gaghị ama maka ya. O kwuru ka-akpọọ onye kọmishịọna ndị uweojii jụọ ya maka nke a. Na nzaghachi Emma Powerful kwuru na okwu Hassan bụ asị na onye Kọmishọna ndị uweojii nọ n'okpuru ya kwesiri ịgwa ya ihe ọbụla mere n'ụlọọrụ ha. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ nkata ndị uweojii na gọọmentị iji megide ndị Ipob nakwa ndị Igbo. BBC Igbo kpọrọ Kọmishọna ndị uweojii Abia Steeti n'ekwentị mana ọ zaghị ekwentị ya. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ" afirika-43359517,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43359517,2019:Ndị Igbo akwadoghị Buhari,Ụfọdụ ndị ndu n'ala Igbo akatọọla akụkọ sịrị na ọ bụ ma Onyeisiala Mohammadu Buhari o were ọchịchị n'afọ 2019 ga-eme ka onye Igbo nwe ike ịchị n'afọ 2023 kwuo na ọ bụ okwu ọnụ ụtọ.,"Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. Onyeisi otu pati United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie gwara BBC Igbo na mkpebi a abụghị maka otu pati, na ọ bụ dịka ụmụ afọ Igbo ha bụ. O kwuru na onweghị etu pati na-ama ọchịchị aka n'ihu ga-eji hapụ otu nke ya bịa na-akwado ọchịchị ọ na-ama aka n'ihu. Okorie kwuru na ọ na-ekwuputa uche nke ya, mana ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-ekwu otu ihe ahụ, ọ pụtara otu ihe a metụtara onye ọbụla dịka ndị Igbo. Gee ihe Chekwas Okorie kwuru ebe a; Chekwas okorie: Agaghị m akwado onye otu ọzọ Ndị ndu n'ala Igbo ndị ọzọ katọrọ atụmatụ ahụ gunyere; onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ ABC Nwosu, onyeisi ọhanaeze ndị Igbo n'oge gara aga bụ Dọkịta Dozie Ikedife, onyeisi ndị Sịnetị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Enyinnaya Abaribe nakwa onyeisi ndị Eastern Consultative Forum(ECA) bụ Elliot Ugochukwu-Uko. Cheta n'oge gara aga, otu onye na-agbasa ozi maka onyeisiala na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Osita Okechukwu kwuru na Buhari bụ otu ụzọ pụtara ihe ndị Igbo ga-eji nweta ọchịchị onyeisiala. O kwuru na Buhari e merela ndị Igbo oke ihe kwesiri iji rita mkpụrụobi ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48014818,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48014818,Rochas Okorocha: Anyị ga-eso ihe ụlọikpe kwuru maka asambodo Okorocha - Inec,Akụkọ a kpụ n'ọnụ ugbua bụ na Ọkaikpe Okon Abang nke ụlọikpe ukwu nke Abụja eserele aka ya n'ihe metụtara ikpe dị n'etiti Inec na aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha.,"Ihe a na-eme na-erughi izuụka ole na ole Ọkaikpe Taiwo Taiwo sepụrụ aka na ya bụ ikpe. Okorocha kpụpụrụ Inec ụlọikpe ka ọ mara ma nke ahụ ọ ga-eme ka ha nye ya asambodo e ji ama onye tozuru ịnọchite anya mpaghara Ọlụ zoonu n'ụlọomeiwu ukwu n'Abụja. Cheta na Inec gbara isi akwara sị na ha agaghị enye Okorocha asambodo maka ebubo na ndị na-akwado ya manyere onye rụru ọrụ ka ihe Bekee kpọrọ ""Returning Officer"" nke ntuliaka e mere na mpaghara Ọlụ n'ọnwa Febụwarị ka a kpọpụta aha ya dịka onye meriri. Mgbe ahụ, Ọkammụta Francis Ibeawuchi gwara BBC Igbo na e tiri ya ihe ma megide ikike dịrị ya. Ibeawuchi N'agbanyeghi na Okorocha gọrọla aka na ụkwu ya n'ihe mere Ibeawuchi, Inec sị na ya bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkakwụ, nke mere ka ha foro ntutu taa n'isi Okorocha na ha agaghị enye ya ohere ịnata asambodo a nke a kpọrọ ""Certificate of Return"". Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Abang esorola ụkwụ Taiwo; amabeghi ma a ga-ekpechakwa ya bụ ikpe tupu o ruo ubọchị nke iri abụo na itoolu nke Mee, bụ oge a ga-edu ndị omeiwu na-abata ọhụrụ n'iyi ọrụ. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye, ịjụ ya etu eke ha si anya anwụ. Okoye sị na okwu ahụ bụ n'aka ndị ụlọikpe ka ọ dịzị. Ọ sị; ""Ihe Inec kpebiri bụ na anyị ga-eme ihe ọbụla ulọikpe sị ka anyị mee. ""Ha sị anyị nye ya asambodo, anyị ga-enye ya asambodo, ha sị ka anyị gaa megharịa ntuliaka ahụ, anyị ga-eme etu ahụ. Ha sịkwanụ na ọ bụ ịga n'ọgbọ vootu dị iche iche gaa chịkọta ọnụọgụgụ vootu, ihe ahụ ka anyị ga-eme."" Akụkọ ga-amasị gị:" mba-uba-44877308,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44877308,Fidelity Bank: Ndị na-eme ngagharị iwe abụghị ndị ọrụ anyị,Ụlọakụ Fidelity agọọla na ndị mere ngharịiwe n'ụlọọrụ ha bụ ndị ọkwọụgbọala ndị ha na-ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ.,"Ndị ọrụ n'ụlọakụ Fidelity mere ngagharịiwe ụbọchị Tuzde n'ụlọọrụ ha dịgasị na Legos iji gosi iwe ha n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa nakwa ọnọdụ ọrụ ha nke ha kwuru na ọ tara ọjị anya. End of Twitter post, 1 Ndị ọrụ ahụ bucha akwụkwọ na-egosi iwe ha gụnyere; 'Kwụọ anyị oke ruru anyị' 'Fidelity Bank, anyị rụtara ego a'; 'obi ọjọọ a akarịala.' Na ozi nke onyeisi ngalaba mgbasaozi n'ụlọakụ ahụ bụ Charles Aigbe binyere aka, ụlọakụ ahụ kwuru na ndị mere ngagharịwe ahụ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ndị ụlọ ọrụ ha na ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ. Ụlọakụ ahụ kwuru na ""ndị ọkwọụgbọala ndị otu ụlọọrụ ha zitere anyị ka ha rụọrọ anyị ọrụ n'oge gara aga. ""Iji mee ka okwu a doo anya, anyị na-ekwusi ike na Fidelity Bank ejighị ndịọrụ ụgwọ ọnwa maọbụ ụgwọ ruru onye a chụrụ n'ọrụ. "" Fidelity Bank boro ebubo na ebumnobi ndị mere ngagharị iwe ahụ bụ ibute mgbochi nye ndị chọrọ iweta maọbụ tinye ego n'ụlọakụ ha. Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agba ndị a na-eme ngharịiwe akwụkwọ n'ụlọikpe. ""Anyị bụ ụlọakụ mara ọrụ dịrị ya ma na-agbasokwa iwu ala Naijiria. Dịka anyị anaghị emegide ndị mmadụ ịgbakọ, ihe ha mere bụ ihe ekwesighị ekwesi. ""Anyị ga-agba ha akwụkwọ n'ụloikpe iji kwụsi mmekpa ahụ a."" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43552588,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43552588,Onye mere Pọnzi: MMM gwuru m chacha ruru nde 3.7,Nwaafọ Naịjirịa mere MMM nke kpọrọ onwe ya Chikaodili (ọ bụgh ị ezigbo aha ya) ekwupụtala etu ya na atụmatụ pọnzi bụ MMM siri gaa n'afọ gara aga.,"Ndị mere MMM na-eru uju na ha enweghizi olileanya maka ọnwụ Mavrodi Ọtụtụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ tufuru ego ha site na atụmatụ MMM a. Ndị ụlọọrụ Nigeria Deposit Insurance Corporation kwuru na ụmụ Naịjirịa soro na ya bụ atụmatụ riri nde atọ na ọma n'ọnụọgụgụ ebe ego furu oge MMM kwasara ruru ijeri 18. Akụkọ kwukwara na o nwere ndị nwere ọbara mgbalielu oge ọ kwasara maka ego ha niile ha mefuru. Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ihe kpatara ụmụ Naịjirịa jiri tinye aka na ụdị atụtmatụ ahụ. N'okwu onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara okwu akanaụba bụ Rotimi Obende kwuru: ""Eziokwu bụ na ụmụ Naịjirịa ka ga na-emefu ego n'ụdị ihe a. ""Nke a bụ maka na ọbụghị ihe niile a na-etinye ego na-egosipụta onwe ha mana n'okpuru, ha dịkwa n'ụdị MMM. Ihe ise gbasara MMM ""Dịka m na-ekwu ugbua, o nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-etinye ego ha ugbua dịka nke a kpọrọ ""Kripto Currency"", nke gbasara ""real estate"" wdgz."" O kwuru na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-achọ ịbanye azụmahịa ọbụla nyocha ya nkeọma ka ọ mara ihe ọ na-abanya na ya. N'okwu ya, ""Ihe kpatara ihe niile ji eme bụ maka anya ukwuu, ndị mmadụ chọrọ iri ebe ha na-akụghị."" Ọtụtụ ndị ọnụ na-erụ n'okwu ekwuola na ụdị ihe a bụ ""fonfoju akpa"". Akụkọ ga-amasị gị: A kọwara na MMM na-enye ndị mmadụ ihe ruru pasenti 30 n'elu ego ole ọbụla mmadụ tinyere rue mkpụrụ ụbọchị 30. Ọ na-etinyekwa pasenti ise ọzọ n'elu pasenti 30 ahụ ma ọ karịa mkpụrụ ụbọchị 30 ahụ. Onye ọ bụla mmadụ wetara, onye wetara ya ga-enweta pasenti 2.5 n'elu ego ọbụla onye o wetara tinyere. Ọtụtụ ndị bidoro na mbu atụmatụ ahụ rachara aka maka na ha jiri ya bụ atụmatụ gbuo ozu. Mana nke a akwụsịghị na ọ bụ pọnzi nke megidere iwu maka na ọ bụ ụzọ weta isi bia were isi." afirika-44017197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44017197,NAPTIP: O teela anyị na-achọ ndị na-eme mpụ a,Ngalaba na-ahụ maka mgbochi mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'aha ịchafụ agbachiela otu ụlọoriri na Abuja ma gbapụtakwa ụmụ agbọghọ ruru iri n'atọ.,"A na-achọ ire ụmụnwaanyị a n'ala Saudi Arabia Onyeisi nyocha a kpọrọ Josiah Emerole gwara BBC na ha nwụchiri ụmụ nwoke abụọ echere na ha na-agba mgbere ebe otu n'ime ha bụ onye na-achịkọta ụlọoriri ahụ. Emerole si na ""O toola aka anyị na-achọ ndi mere ihe ma na-enyocha akụkọ anyị nụrụ maka otu ụlọriri dị na Gwagwalada n'Abuja"" Ụfọdụ ndị na-agba mgbere na-eji ụlọọrịrị ahụ mee ebe nchekwa ""ngwa mmadụ"" ha Ha kwuru na ha na-eme nyocha zuruoke tupu ha a kpụrụ ndị a ga-ba ụlọịkpe maka ebubo e boro ha. Onyeisi NAPTIP ahụ kwuru na otoola aka a na-achụ otu onye n'ime ndị a nwụchiri. Ụfọdụ ndị ọzọ na-ejikwa ebe ahụ ezo ụmụnwaanyị ha chọrọ ị buru ga mba Saudi Arabia. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-48585271,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48585271,NASS Elections 2019: Ndigbo agbazị aka n'ọchịchị Naịjrịa?,Nwanne ụnyaahụ bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Juun nke afọ 2019 ka e mechara ntuliaka a ga-eji họpụta ndị ga-achị Naịjirịa n'isi isi dịka ahọpụtara ndị isi Ụlọomeiwu nke ukwu na obele.,"Ka ọ kwụ ugbua, 2019 ga-eme ya mbụ ndị si Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa esoghị n'ime ndị isi isi a kemgbe Naịjirịa nwere onwe ya site n'aka mba Briten n'afọ 1960. Nnyocha ebe ndị isi a hụrụkwawa okpu na ngalaba gọọmentị atọ e nwere na Naịjirịa ugbua sI ihe a ga-ahụ bụ: Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ihe o jiri dị otu a bụ makana pati nwere mmeri na ntuliaka 2019 bụ pati na-achị a kpọrọ 'All Progressives Congress' na Bekee ekenyeghị ndị Ọwụwa-Anyanwụ oke ọchịchị n'oge a, n'agbanyeghị na enyere ndị sị mpaghara ahụ tozuru iyi okpu eze n'Ụlọomeiwu abụọ e nwere. Mmadụ dịka Orji Uzo Kalu pụtara ịzọ osote onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu tozuru dịka ọ rụbụrụ ọrụ dịka onyeomeiwu n'afọ 1992 tupu ndị agha batakwa kagbuo nhọputa e mere na 1993. N'Ụlọomeiwu Nta, Nkiruka Onyeajeocha so zuo ọchịchị tozuru dịka onye so na ndị tọchara n'Ụlọomeiwu Nta. N'afọ 2015, APC kenyere Ọwụwa-Anyanwụ ohere iwepụta onye ga-abụ onyeisi Ụlọomeiwu, mana ka e mechara ntuliaka, o nweghi onye si pati APC nwetara ọkwa onyeomeiwu Ukwu, nke mere pati ahụ jiri kenye Ugwu Naịjirịa ọkwa ahụ. Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe Ndọrọndọrọ ọchịchị na nkwekọrịta pati anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) na ndi nupuru isi n'ihe pati APC chọrọ nwere wepụtara Ike Ekweremadu - bụ onye Ọwụwa Anyanwụ - ka Osote Onyeisi Ụlọomeiwu ukwu. Na 2019, Ike Ekweremadu sepụtakwara isi, n'agbanyeghị na ọ nọ na pati anọghị n'ọchịchị, wee zọọ ọkwa ahụ ọzọ mana Ovie Omo-Agege meriri ya. Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-etinye ọnụ n' ọnọdụ ndị Ọwụwa Anyanwụ n'ọchịchị Naịjirịa. Onye ntakukọ ama ama bu Kadira Ahmed sị n' ọnọdụ ndị Ọwụwa Anyanwụ adịghị mma, ọkachasị ma etinye uche n'ọnọdụ Naịjirịa ugbua. Mana onye aha bụ Genevieve Mordi sị na ya e cheghị na ndị Ọwụwa Anyanwụ na-ahụ ọnọdụ ahụ dị ihe na amapụ ha obi makana ha adịghị echekwube gọọmentị. Ọnụ na-ekwuru APC na Legọs bụ Joe Igbokwe sị na ihe a mere ekwesịghị ịtụ onye ọbụla si Ọwụwa Anyanwụ n'anya makana ha gbajọrọ pati APC ma kọọ Onyeisiala Buhari ọnụ na gọọmentị ya bụ nke ndị Fulani. ""Kedu ihe ha na-achọzị na patị ndị ọchịehi?"" bụ ajuju Maazị Igbokwe jụrụ. Mana Chuks Iluegbu bụ ọnụ na-ekwuru Ohaneze ekweghị na nke ahụ. Ọ sị na dịka esi kee Naịjirịa, onye nke a were, onye ọzọ ewere. Ọ gakwara n'ihu sị na ndọrọndọrọ bu ihe a na-eme dịka okete orie, mana ""ka udo dị, e wee werekwa abụghị ihe ọma."" ""Aka akawa ahụ, yabụru na ọ bụ sọ otu ka onye Igbo di na pati ha, enye ya ya, ka udo dị."" 2019: E ji Ndigbo eme akaje Reverend Peace bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuru otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu a were sị na Ndigbo gba aka na Naịjirịa mana ha agbaghị aka. O kwukwara na ọnọdụ a dị mma iji gosi Ndigbo na o nweghi oke ha nwere na Naịjirịa. O kwuru: ""Ihe a mere ka anyị were chọwa obodo Biafra ma chọsie ya ike."" Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Ọkaiwu Chima Nnaji. Ọ sị na Ndigbo bụ nnu dị na Naịjirịa. N'ọnụ ya: ""I sie nri ma ghara itinye ya nnu, ị gaghị eri ya bụ nri ọkara"", ma kwukwa na e sibe ofe ma wepu Ndigbo, na agaghị esicha ya bụ ofe. Nnaji nyere Ndigbo ndụmọdụ sị ha na onye ajụrụ anaghị ajụ onwe ya." 45742576,https://www.bbc.com/igbo/45742576,"Ị ma na ""selfie"" nwere ike isete ọnwụ?","Ị na-akwado ise onwe gị foto nke Bekee kpọrọ 'selfie?' Gbazie anya, ka ị ghara isi n'ọṅụ fere n'ọnwụ.","Ị ma na inwere ike isi n'ọṅụ fere n'ọnwụ ka ị na-ese onwe gị foto? Nchọpụta nke 'All India Institute of Medical Sciences', otu jikọrọ ụlọaakwụkwọ ahụike na mba Indịa, mere, ekwuola na mmadụ ruru 259 anwụola na mbaụwa oge ha na-ese onwe ha foto n'afọ isi gara aga. Nchopụta nke e depụtara n'akwụkwọ a kpọrọ Journal of Family Medicine and Primary Care, ndị nwụrụ ebe ha na-ese onwe ha foto karịrị na mba Indịa, ebe Russia,US nakwa Pakistan na-eso ha. Ụfọdụ bụ ndị mmiri gbagburu, ụfọdụ bụ ndị nwụrụ na njem, ebe ụfọdụ dakpuru ọkụ maọbụ si n'oke elu daa. Mana ụdị akụkọ a abụghị ihe ọhụrụ n'ebe ụmụ Naijiria nọ, dịka ụfọdụ ụmụafọ ala a sọ n'ọtụtụ nwụrụla dịka ha na-ese onwe ha foto. Lee ugboro iri mmadụ zutere ọnwụ dịka ọ na-ese onwe ha foto na nsonso a: 1. Mmiri riri otu onye ji otu afọ efe ala Naịjirịa na Bayelsa N' ọnwa Mee afọ a(2018), otu onye ji otu afọ efe ala Naijiria amaghị aha ya danyere na mmiri, mmiri rie ya dịka ọ na-ese onwe ya foto ọ ga-eji na-echeta ife ala nna. Ọdachi a mere n' Ogbolomaibiri, Nembe dị na Bayelsa steeti oge nwa amadị a onye nọ nelụ ụgbọmmiri a na-akpọ Jetty mịchapụrụ danye na mmiri oge ọ chọrọ ise onwe ya foto. 2. Ụmụ akwụkwọ mahadum Ondo abụọ nwụrụ oge ha na-ese onwe ha foto n'ime ụgbọmmiri Olabiyi Emmanuel na Olokun Babatunde Alex bụ ụmụakwụkwọ Federal University of Technology, Akure(FUTA ), Ondo steeti nwụrụ ka ha banyere n'ụgbọmmiri dị na mmiri mahadum ahụ na-azụ azụ dị nso ebe ha gara ọgbakọ nkuzi ọrụaka. Ha dị mmadụ anọ banyere ụgbọ ahụ, mana abụọ sọtara onwe ha mgbe ụgbọmmiri ahụ gburu. 3. Otu nwoke Indịa nwụrụ ka ọ na-ese onwe ya na anụọhịa a kpọrọ 'bear' foto Nke a mere na agbanyeghị na ndị enyi ya dọrọ ya aka na ntị ka ọ ghara ise ya bụ foto. 4. Nwaanyị Bangkok nwụrụ nokporo ụgbọoloko Ọdọ ụgbọoloko dí na Bangkok Nke mere oge ya na enyi ya nwaanyị na-ese onwe ha foto n'okporo ụgbọọloko na amagị na ụgbọ na-abịa. Ụgbo ahụ gbujiri ya ụkwụ , omecha nwụ n'ụlọọgwụ, ebe enyị ya nwoke merụrụ nnukwu ahụ. Anụ ọhịa bear merụrụ ahụ tagburu nwoke ahụ oge ọ gara ya nso ise ya foto na agbanyeghị na ndị enyị dọrọ ya aka na ntị. 5. N'ọnwa Septemba, nwa dị afọ 18 nwụrụ ka ọ dara site n'elu Nevanda Fall Nne nwata ahụ kwuru na ọ chọrọ ise onwe ya foto na mmiri ahụ dị n'ogige Yosemite National Park dị n'ala Amerịka. 6. Mmiri riri ụmụagbọghọ Sri Lanka abụọ bi n' Oman ka ha na-ese onwe ha foto Ụmụada nwụrụ ka ha chọrọ ise foto na mmiri ọgbanaeleu dị na Salalah, Oman. 7. Ụmụnne abụọ ndị Indịa nwụrụ ka ha na-ese onwe ha foto na nso okporo ụgbọoloko Nke a mere n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2018. 8. Ndị amaala Canada atọ nwụrụ ka ha dagburu mmiri Mmiri buru Megan Scraper, onye a ma ama na Youtube maka ise ihe nkiri njem nlegharị anya na nso mmiri ọgbanelu dị na British Columbia. Isi Ryker Gamble na Alexey Lyakh bụ enyi Megan nakwa ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ soro ya dịka ha chọrọ ịzọbụta Megan. 9. Nwaagbọghọ Nu Ziland dagburu mmiri ka o sechara onwe ya foto Nke mere na Canada oge ya nwaanyị aha ya bụ Danni Hogan na enyi ya nwoke na-aga njem nleghari anya n'ọnwa ọgụst 2018. 10. Onye China nwụrụ na mba Indonesia ka ọ danyere mmiri ebe ọ na-ese onwe ya foto Nke a mere na Nusa Lembongan dị na Bali, Indonesia." afirika-50002731,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002731,Sadiya Umar Farouq: Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị,Dịka ka akụko na efeghari na Sadiya Umar Farouq na onyeisiala ga-agba akwụkwọ taa.,"BBC jụrụ onye enyemaka ya ma eziokwu o dị n'akụkọ a . Ọ gwara BBC na akụkọ ahụ bụ ezigbote asi. Kedu Onye bụ Sadiya Umar Farouq? Sadiya Umar Farouq bụ Mịnista na-ahụ maka ihe gbasara mmadụ, ọrụ gbata gbata na mmekọrịta madụ na ibe ya. Bekee kpọrọ ngalaba ahụ 'Ministry of Humanitarian Affairs, Disaster Management and Social Development'. Nke a bụ otu n'ime ndị ngalaba onyeisiala Muhammadu Buharị kewapụtara ọhụrụ n'afọ a. A mụrụ Sadiya Umar Farouq na Nọvemba 5, 1974. Ọ bụ onye Zamfara steeti n'okpuru ọchịchị Zurmi dị na mpaghara ugwu nke Naijirịa. Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na 'Federal Girls college' nke dị na Gusau, Zamfara steeti. Ọ nwere asambodo ""Business Administration"" na mahadum nke Ahmadu Bello Zaria, Kaduna Steeti. O nwekwara asambodo osote ọkammụta na ""International Affairs and Diplomacy"" ma tinyekwa nke ""Business Administration"" (MBA) sitere na Mahadum Ahmadu Bello. Farouq bụbu onyeisi ngalaba na-elekọta ndị gbatara ọsọ ndụ na Naịjirịa nakwa ndị enwghị ebe obibi n'ihi agha maọbụ ihe ndapụta. Ọ ruburu ọrụ dịka onye ojide ego ndị 'All Progressive Congress' site n'Ọnwa Jun 2013 ruo Jun 2014. O sokwa na ngalaba nke APC hụrụ maka nhọpụta Buharị dịka ọnyeisiala Naijirịa. Farouq bụkwa onye ojide ego otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Congress for Progressive Change' ebe Buhari nọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2011. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45734231,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45734231,Etu ị ga-esi ji N5000 debanye aha ụlọahịa gị n'akwụkwọ,"Ndị ọrụaka na ndị mgbere e nwela ohere ọhụrụ iji debanye aha n'akwụkwọ n'ọkara ego eji emebu ya site n'ọnwa October 1 ruo December 31, 2018.","Gọọmentị kwuru na ha na-agba mbọ ị hụ na ndị na-azụ ahịa nwetere ezigbo enyemaka Osibanjo belatara ego a n'ọgbakọ mmụta nke iri na itoolu ndị akaọrụ na ndị mgbere mere n'ụbọchị October 2 n'Enugwu. End of Twitter post, 1 Osibanjo kwuru na nke a bụ iji kwado mkwa gọọmentị kwere maka ị mee ka ọnọdụ eji eme azụmahia na Naịjịrịa dị fecha fecha. O kwuru na ndị na-atụ mgbere ahịa bụkarị ndị na-eme ka akụ na ụba Naịjirịa gbagote elu ya mere onyeisiala jị gba mbọ ị hụ na nwetere ihe ọ bụla ga-enyere ha aka n'ịzụ ahịa ọfụma ma nweta nnukwu uru. Ndị na-atụ mgbere ga-eji obere ego debanye aha n'akwụkwọ ụgbua ruo ọnwa December 31 nke afọ 2018 O kwuru na ihe mere eji wepụta ya bụ ohere bụ na gọọmentị ha chọpụtara na ụfọdụ na-azụ ahịa na-abịa ya bụ ọgbakọ adịghị enwe ohere ị debanye aha ụlọ ahịa a n'akwụkwọ maka ọnụ ego dị oke ọnụ. Ndị na-azụ ahia na Naịjirịa na-ekwu karị na ha a naghị enweta ezigbo enyemaka n'aka gọọmentị Osibanjo kwuru na ọ bụ ihe ndị ọ bụ ọrụ ha ị debanye aha n'akwụkwọ na-eme kwa mgbe mgbe n'ọgbakọ ahụ ịji hụ na ha weturu ọnụ ego eji eme ya. Akụkọ ndị ga-amasị:" afirika-45011177,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45011177,Buhari ezigala ndị agha 1000 na Zamfara steeti,Gọọmentị Naịjirịa ezigala ndị agha dị otu puku na mpaghara ugwu Zamfara steeti iji gboo nsogbu nchekwa gbara obodo ahụ gburugburu.,"Ndị ọrụ nchekwa a gụnyere ndị agha ala, ụgbọelu, ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa 'Civil defence' ga-ejikọta aka ọnụ buso ndị a na-eyi ndụ egwu agha. Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu gwara BBC na ndị agha ụgbọelu nọ n'ụzọ Katsina ugbua bụ ebe ọdọụgbọelu dị Zamfara steeti nso nọ. O kwuru na ndị agha ụgbọelu a ga-eji igwe 'satellite' dị n'elu chọpụta njem ndị a na-eyi ndụ egwu na-eme na mpaghara ahụ. Shehu kwuru na ọ maghị oge ọrụ ole ndị nchekwa a ga-anọ na Zamfara steeti mana nke a bụ ugboro abụọ a na-eziga ndị agha dị ọnụọgụgụ ukwu na mpaghara ahụ. Gọọmentị Zamfara steeti kwuru n'ime mwakpo ahụ, ihe ruru obodo iri na asatọ alaala n'iyi, ihe ruru mmadụ puku iri na asatọ agbafuola n'ebe obibi ha ebe e gburu ihe karịrị mmadụ otu narị. Ndị a na-awakpo obodo, gbaa ụlọọkụ ma tọọrọ ndị mmadụ n'ihi ego. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49639314,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49639314,Busola Dakolo: 'Nyem N10m ma rịọ m mgbaghara',Busola Dakolo ekwuola na Biodun Fatoyinbo ga-akwụ ya 10m maka ihe ọ gabigara n'aka ya.,"N'ikpe nke Busola Dakolo tinyere n'ụlọikpe ahụ o kwuru na mwakpo Biodun wakporo ya metụtara alụmdinanwunye na n'ụzọ adịghị mma. O kwukwara na ọ chọrọ ka Fatoyinbo dere ya akwụkwọ edemede rịọ ya mgbaghara iji gosi nchegharị maka ihe o mere ya. Ụlọikpe ukwu n'Abuja akpọọla Busola Dakolo na Onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyibo oku ka ha bịa zara ọnụ ha. Ụlọikpe ahụ nyere ha abụọ abalị iri na anọ iji gosi onwe ha ma kwuo uche ha gbasara okwu ahụ. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, Dakolo kwuru na ọgụgọ niile Fatoyinbo na-agọ kemgbe o boro ya ebubo na-enyekwa ya oke nsogbu n'uche ya. Cheta na Busola Dakolo boro Biodun Fatoyibo ebubo mmetọ n'ụzọ ezighi ezi mgbe ọ ka bụ nwa agbọghọ. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44014336,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44014336,Ọkụọgbụgba erefuola ego ruru nde naira 506 n'Anambara,"Akụ na ụba ruru nde naira 506 abụrụla ihe etufuru etufu n'ọkụ ọgbụgba 68 merela na Anambara site na ọnwa Disemba 2017 ruo n'ọnwa Epreelu 2018,","Ọkụ ọgbụgba na-emebi ọtụtụ akụ na ụba maọbụrụ na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ azaghị oku ọsịsọ Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpinyụ ọkụ n'Anambara steeti bụ Martin Agbili kwuru nke a n'emume ncheta ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na mbauwa niile n'Awka Isiokwu emume a bụ:""Technology in Emergency Response and Support for Firefighters''. Nke a pụtara n'asụsụ Igbo, iji Teknụzụ kwado ndị ọrụ mpinyụ ọkụ. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ chọrọ ka enye ha ọtụtụ ngwọ ọrụ Agbili kwukwara na ya na ndị otu ya zọpụtara akụ na ụba ruru ijeri naira 11.2 n'oge ahụ maka sọkwụ sọkwụ ha jiri bia zaa oku mpinyụ ọkụ. O kwuru na emume na-enye oher iji wee kọwapụta mmeri nakwa nsogbu ndị ọrụ mpinyụ ọku na-enwe n'ọru. Agbili jikwa ohere cheta ndị otu ya nwụrụ ebe ha na a pinyụ ọkụ ,na-arịọkwa ka enye ndị be ha ezigbo ego nkasiobi makana ego ha na-enye ndị na-arụ udiri ọrụ na-etinye ndụ ha nsogbu. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na-etinye ndụ ha na nsogbu ma ha na-arụ ọrụ Ọ rịọkwara ka-enye kwuo ha ngwọ ọrụ ha ga-eji na-arụ ọrụ karia nke ha rugoro arụ. Agbili kenekwara Gọvanọ Willie Obiano maka nkwado ọ na-enye ya na ndị otu ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-53753691,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53753691,Coronavirus n'Afrịka: O meela ọnwa isii coronavirus batara Afrịka,Otu jikọrọ mba niile dị n'Afrịka bụ 'African Union' akpọọla oku ka onye ọbụla kee ajị n'ume dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus agafeela otu nde.,"Onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo mere nnyocha maka coronavirus Dịka ndị AU si kwuo, ọkara ndị niile bu ya bụ ọrịa n'Afrịka bụ na Saụt Afrịka. Ha kwukwara na ihe na-eme na Tanzania na-awa ha isi n'ihi na mba ahụ enweghị ezi ọnụọgụgụ maka ndị bu ya bụ ọrịa. Onyeisi ngalaba mgbochi ọrịa na-efe efe na AU bụ John Nkengasong kwuru sị: ""Anyị arịọla Tanzania ka ha nye anyị ezigbo ọnụọgụgụ maka ndị bu Covid-19 mana ha enyebeghị anyị ọsịsa ziri ezi."" Mba kacha nwee ndị bu coronavirus n'Afrịka Ndị ọkacha mara ekwuola na onweghi onye ma nke bụ eziokwu mmadụ ole bu coronavirus n'Afrịka n'ihi na ọnụọgụgụ ya ezuchaghị oke. Ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla n'Afrịka niile n'ihi ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 690,000 agbakeela. Mba kacha nwee ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus n'Afrịka John Nkengasong kwuru na nnyocha Covid-19 e merela n'Afrịka agafeela nde asatọ, mana ọ bụrụ na ihe gara etu e si chee, o kwesila ịgafe nde 13. Ijipt bụ mba izizi coronavirus batara n'Afrịka n'ọnwa Febrụwarị 2020, dịka ọ gachara izuụka atọ ya bụ ọrịa banyere na Yurop. Ka ọ dị ugbua, Saụt Afrịka na Ijipt bụ mba abụọ ọrịa a kacha akpa ike n'Afrịka niile. Mba coronavirus kacha gbuo mmadụ n'Afrịka Mana John Nkengasong gwara BBC na ụlọọrụ ya jikwa ọdụ anya ele mba ụfọdụ ebe ya bụ ọrịa ji nwayọ agbalite dịka Naịjirịa, Gana, Kenya, Etiopia, Sudan, Zambịa na Zimbabwe. Ndị ọkachamara etoola Afrịka maka mbọ ha gbara igbochi mfesa coronavirus, ọkachasị etu ha si kpọchie mba ha n'oge. Nke a kpatara na ndị bu coronavirus n'Afrịka dị nta karịa ndị nke Yurop (otu nde na ụma) nakwa ndị nke Amerịka (nde anọ na ụma). Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ n'Afrịka anaghị eme nnyocha maka ọrịa a etu o kwesịrị. Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi nke e mepụtara na Mahadum Oxford dịka ọ na-arụ ọrụ. A gbara ụfọdụ ndị mmadụ ya bụ ọgwụ na Saụt Afrịka. Mana John Nkengasong na-ekwu na ihe ga-aka enye aka bụ ndị mmadụ iyi akwa mkpuchi imi Bekee kpọrọ 'facemask'. Mara ma mask ọ ga-egbochi gị ibute ọrịa Coronavirus Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: Coronavirus Tips: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus?" afirika-48175874,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48175874,UNGA: Onye bụ Tijjani Bande?,Nke chi bọkwụtere ụnyahụ bụ na Naịjirịa abụrụla ndị nchịkọta nzụkọ UN bụ United Nations General Assembly.,"Tijani Bande onye nchịkọta nzụkọ UN Onye ọ dara n'ubu ya bụ ọkamụta Tijjani Bande bụ onye nchịkọta nzụkọ UN nke iri asaa na anọ (74) bụ nke ga-amalite n'ọnwa Septemba 2019. Ihe ndị a ka ị kwesiri ịma maka ya bụ nwaamadị nke María Fernanda Espinosa Garcés, onye nchịkọta nke na-apụapụ kpọpụtara ụnyahụ n'Abụja. Gịnị bụ Onye nchịkọta UN ""General Assembly?"" Ọnọdụ nchịkọta nzụkọ UN ""general assembly"" bụ ọkwa onye na-achịkọta nzụkọ n'United Nation. A na-ebugharị ọkwa a kwa afọ sịte na obodo ga obodo. Okwa a anaghị erụ mba nwere agba dịka US, China, Canada na ndị ọzọ aka. Mba ọbụla sọ na nzụkọ nchekwa enweghị mgbanwe na UN agaghị esi ọkwa ahụ imi. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-51793801,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51793801,Man United vs Man City: Udu ndị Man City ji bịa ichu iyi na be Man United akụwasịala,Manchester United emeela nwanne ha Man City e cheta e bewe site n'iji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie ha na premier league.,"Anya mmiri pụrụ onye nchịkọta Man City bụ Pep Guardiola n'anya mgbe ụmụnne ha gbawara ha obi nke ugboro abụọ. Dịka umunne maara onwe ha nke ọma, ọ dịghịrị mfe inye goolu n'asọmpi a ruo na nkeji 30 mgbe oche goolu ndị City bụ Ederson meghere ka Anthony Martial ji nye goolu. Man City gbalịrị ike ha inyeta goolu mana Man United ji igodo gbachie ọnụụzọ goolu ha. Mana nke kachasị gbawa ndị Man City obi bụ mgbe Scott McTominay nke Man United nyere goolu ha nke abụọ na nkeji 90 dịka ọ fọrọ tịkọm tịkọm ka e gbuchie bọọlụ. Ole gunnar solskjær emeriela Guardiola ugboro abụọ ha na-ezute ibe n'asọmpi premier league nke afọ a. Mmeria na-eme ya ugboro iri emeribeghi ndị Manchester United na nso nso dịka ha bụ ndị ise na tebụlụ premier league. Chelsea ayọchaala Everton ka akamụ ndụ Ihe Chelsea mere Everton n'asọmpi premier league dịka ebe okenye kpọbatara nwata n'ime ụlọ ma were agbajara na-apịazu ya ahụ niile. Ụkwụ Everton jiri malite asọmpi a abụghị 'ụkwụ nnama ji a ga Ụmụahịa'. Ha dịka ndị ike gwụrụ tupu asọmpi amalite. Nke a mere Chelsea ji were ohere ahụ gbaa aha ọkpụ goolu anọ chara acha iji sị ha 'anyị a na-achịkwanụ?' Ọ malitere na nkeji 14 mgbe Mason Mount gbara gburu gburu sụnye goolu nke mbụ ndị Chelsea. Na nkeji asaa (nkeji 21) na-eso ya Pedro nyere goolu nke abụọ. Mana Chelsea ezughi ike dịka ha tara ọtụtụ ohere inye goolu. Anclotti bụbụ onye nchịkọta Lampard n'afọ 2009 banye 2010 mgbe ọ na-achịkọta ndị Chelsea Mgbe ọkara nke abụọ malitere Willian na Olivier Giroud nyere goolu nkeji 51 na 54 iji mee ya goolu anọ. Lampard bụ onye nchịkọta Chelsea asọghị anya na Ancelotti onye nchịkọta Everton bụ onye nkuzi ya n'oge gara, o wee nye ya ụdị mkparị a. Nke a ga-abụ ugboro abụọ Lampard na-emeri ndị nkuzi ya (Mourinho na Ancelotti) kamgbe o were ọkwa na Chelsea. Mmerie a dosara Chelsea n'ogodo anọ na tebụlụ premier League." afirika-46771571,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46771571,Python Dance III: Etigbula ndị ị kwesiri ịchekwa - Ndị Gọvanọ ọwụwaanywanwụ,Ọgbakọ ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ esila n'ọnụ onyeisi ha bụ Gọvanọ Umahi gwa ndịagha ha gbado anya n'ọrụ ha.,"Rụọ nụ ọrụ 'egwu eke' ọfụma Ha kwuru okwu gbasara atụmatụ ndịagha kpọrọ egwu eke ndịagha Naịjirịa malitere ịme n'ala Igbo. Umahi gwara ndịagha na nsogbu agaghị adị dịka o meburu n'etiti ha na ndị Ipob nakwa otu ndịọzọ boro ha ebubo ogbugbu mmadụ. O kwurukwara na ndịagha chọọ ụzọ ha ga-eji metuo obi ndị ọwụwa anywanwụ iji mee ka olileanya atụkwasiri na ha gbalite. ""Dịka a na-akwado ntuliaka afọ 2019, gbaa nụ mbọ hụ na unu ruru ọrụ unu n'ụzọ ziri ezi"" ka Umahi kwuru Abubakar Maikobi bụ onye nọchitere anya onyeisi ndịagha kasiri ndị mmadụ obi maka etu ha ga-esi rụ ọrụ ha. O kwuru ka obi ndị mmadụ dajụọ n'ihi na ha ga-arụ ọrụ ha dịka akwụkwọ iwu siri kwuo n'akwụnyeghiri otu ndọrọndọrọ ọbụla na ntulaiaka n'abịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-43851458,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43851458,Man United agafela n'agba ikpeazụ asọmpi iko FA,Ndị Tottenham buru ụzọ nye goolu tupu Man United e si na-azụ bịa sa ya ma merie ha n'asọmpị ahụ.,"N'ime nkeji iri abụọ na anọ, Alexis Sanchez nke Manchester United sara ọkpụ goolu ahụ, tutu ha ga-ezuike. Onye nyere Tottenham goolu bụ Dele Alli n'ime nkeji iri na otu. N'ime nkeji iri abụọ na anọ, Alexis Sanchez nke Manchester United sara ọkpụ goolu ahụ, tutu ha ga-ezuike. N'ime agba nke abụọ ha lọtara ezumike, asọmpi ahụ bịara sie ike nke ukwuu. Akụkọ ga-amasị gị: Mgbe o ruru nkeji iri isii na abụọ, Ander Herrera nke Manchester United sụnyere ọkpụ goolu nke abụọ. Alexis Sanchez bụ onye kacha apụta ihe n'asọmpi ahụ nke akpọrọ ""Man of the match"". Manchester United kpachiri na-ekweghị ka enye ha goolu ọzọ rue mgbe asọmpi ahụ gụrụ. Nke a pụtara na Manchester United etozuola oke ịgba asọmpi nke ịkpeazụ nke iko FA. Ha na-atụ anya ezute onye ga-enweta mmeri n'etiti Chelsea na Southampton. Lee ihe ụfọdụ ndị Man United na-ekwu n'akara tuwitta:" afirika-45523094,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45523094,Aha Igbo: Ihe kpatara ndigbo ji kwụsị ịgụ ụmụ ha ụfọdụ aha,"Mgbe elu ka bụ ala ọsa, ọtụtụ ndigbo na-agụ ụmụ ha aha 'dị omimi', mana ọnọdụ ahụ agbanweela ugbua?","""Ihe mụ na di m gabigara butere ụdịrị aha anyị gụrụ ụmụ anyị"" Aha bụ otu njirimara mmadụ, nke a ma dịka 'identity' n'olu Bekee. Ọtụtụ oge ka aha na-akọwa ihe mmadụ gabigara na ndụ ya, maọbụ ọnọdụ onye ahụ maọbụ ezinaụlọ ya maọbụ agbataobi ya nọ oge a mụrụ ya. Mgbe gboo, ndị Igbo na-agụ aha dị omimi ọ ga-abụ ị kpọbiri ya, ị nwereike ghara ịnweta ihe ọ pụtara, mana ị kpọruo ya n'isi, ị ghọta ihe ọ pụtara. Ọmụmaatụ bụ 'Ogugbuoaja'...Ị kpọbiri ya etu a, ụjọ nwere ike ịtụ ndị mmadụ ịba ya nwa ha, mana ị kpọruo ya n'isi 'Ogugbuoaja-aja anaghị adị ire', mma ya bụ aha apụta. Anaghị anụ aha ndị dịka 'Nkechereonyedịrịlaya', 'Akadịnmmajideakụ' maọbụ 'Nwokejiezi' maọbụ 'Ahụnwaelotanna', ugbua, makana ụfọdụ 'ndị ọgbara ọhụrụ' na-ahụta ya ka aha na-adịghị atọ ụtọ na ntị. Ụfọdụ kwụsịrị ịgụ ụdịrị aha a makana ha kwenyere na ụka butere mgbanwe n'etu ndị Igbo si agụ aha, nke mere na ọtụtụ aha ndigbo na-enwe 'Chukwu' n'ime ya. Nkwenye ụfọdụ bụ na aha ndị ahụ nwere ike ibutere onye na-aza ya chi ọjọọ. Amarachi Nwankwo kwuru ihe mere o ji gụọ ụmụ ya 'Ọdụagụ' nakwa 'Beelụchukwu'. Gee ya n'uju: ""A gụrụ m nwa m aha ihe ga-atụ egwu ịmetụ aka"" Ugbua, ọ dịzị ka ndị mmadụ anaghị eche aha eche tupu a gụọ nwa ha aha. Ụfọdụ na-akpọ aha ndị dịka 'Mọnde, Fraịde', nke bụ aha ụbọchị a mụrụ ha. Oriakụ Leticia Ezeh kọwara ihe mere o ji họrọ aha ọ gụrụ ụmụ ya. Gee ya n'uju: ""E ji m aha nwa m zaa ajụjụ bụ aha di m"" Ọkammụta Chiagozie Nnabuihe, gwara BBC Igbo na ụwa agbanweela ugbua, nke metụtara etu e si agụ aha. O kwuru na Igbo na-agụbu aha site n'ụzọ atọ: Gee ihe o kwuru n'uju: ""Igbo na-agụbu aha site n'ihe a tụrụ anya"" Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47202453,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47202453,Onnoghen: Ngalaba UN akatọọla ọrụ a chụrụ ya n'ike,Ọgbakọ mba ụwa niile nke akpọrọ UN akatọọla ọrụ akwụsiri ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ike.,"Justice Walter Onnoghen UN kwụsịke na-ekwu na ọchụchụ ya dara iwu metụtara nchekwa oke ruru mmadụ. Ebe onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na o mere ihe o mere site n'iwu otu ụlọikpe na-ahụ maka omume kwụọtọ nyere, UN na-ekwu na ụlọikpe anọ ka nke ahụ enyela iwu ka a tụgharịa ikpe ịchụ Onnoghen. Ndị ndọrọndọrọ na Naịjirịa katọkwara nke a maka na n'uche ha, ọ bụ okwu ndọrọndọrọ butere ọchụchụ Onnoghen. Cheta na mba Amerịka, mba Briten nakwa ọgbakọ mba EU tinyere ọnụ n'okwu a mgbe a chụrụ Onnoghen n'ọrụ. Ihe i kwesịrị ịma maka Taiwo Ogunjobi lara mmụọ Na ndọrọndọrọ Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ọgbagahara dara n'ọgbọ ebe onyeisiala Muhammadu Buhari na-eme achụmnta vootu ya n'Ogun steeti taa. Nsogbu bidoro oge ndị nọ ebe ahụ malitere kwawa Adams Oshiomhole emo ma na-ama ya iche mgbe Oshiomhole kpọrọ aha onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ha. Na mba ofesi, Na mba Ofesi otu ụlọikpe na mba Ijipt amaala ndị uweojii atọ ikpe maka etu ha si jiri mmegbu gbuo otu nwoke e chere na ọ dara iwu. Ụlọikpe ahụ kwuru na ha ga-aga ụlọmkpọrọ afọ atọ. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-45424843,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45424843,Anambra: Mmiri enweghi onye iro abụghị maka idemmiri,"Ụfọdụ oge, mbuze na-eji nwayọ nwayọ gosi onwe ya ma ụkpụrụ ya tupu ọ kpaa ike mana ụfọdụ oge, ndị mmadụ anaghị eleba ya anya.","Oke idemmiri gbawara ụzọ si Ụmụawụlụ, Nibo, Ọgbụ aga Ọka dị n'Anambara steeti mara ọkwa ogologo oge tupu o wee gbawa ụzọ mana ekele dịrị chukwu na onweghi onye ọ tara isi ya. Mana lee etu o si bido Mmiri hapụrụ ụzọ a waara ya n'ọwa dị n'okpuru ụzọ a tinye isi n'akụkụ ọwa ahụ bido ịwachapụ aja dị n'okpuru ụzọ ahụ. O buru ụzọ guo olulu a, mana onweghi onye mere ihe ọbụla. Mmiri ga-achọtarịrị ụzọ ebe o si aga ma ọ bụrụ na o nwee ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ. Ide mmiri na-eji iwe na ọnụma na-abịa oge ọbụla, nke mere o ji ebu ihe niile dị n'ụzọ ya. Ụdị mmiri na-awụ n'ahụ aja nwereike ịwụchapụ aja na ntabi anya buru ma ụlọ. Idemmiri a buru ụgbọala a dị n'ime ya Ihe malitere dịka obere olulu bụ ihe gbawara ụzọ abụọ etu a, gbochie ụgbọala niile kwesiri ị ga n'ụzọ ahụ agaghị agali. Ndụ ndị Ụmụwụlụ na obodo ndị ọzọ nọ n'akụkụ ha abụbeghi otu kamgbe idemmiri ahụ kewachara ụzọ ahụ. Onye nkwuchite otu obodo Ụmụawụlụ bụ Chukwuma Okpala gwara BBC Igbo na ya bụ ihe ọdachị emela ha nwịị maka na o metụtara akpa ha. N'okwu ya, 'Ebe anyị na-ejibu naanị naịra iri ise aga, anyị na-ejizi narị naịra abụọ aga ya, agbanyeghi na ụzọ ahụ dị ogologo karịa ma dịkwa njọ maka ndị ọjọọ na-anọ na ya. ""Ịga ụzọ ahụ bụkwa ihe ize ndụ maka na ọ bụghị ebe ndị mmadụ na-agakarị."" Okpala kwuru na o metụtakwara azụmahịa ha maka na ndị obodo ha na-akọ ugbo anaghị agalizi Ọka ị ga ree ihe ha kọtara ma ndị mmadụ si okpuru ọchịchị ndị ọzọ abịa ahịa ebe ahụ anaghị abaịalizi. O kwuru na nke a mere na ndị ọrụugbo ha anaghị eritazi elele nkeọma maka na ha na-esi n'imi akwụ ụgwọ ụgbọala ga-akwọga ha ahịa site n'ogologo ụzọ ọzọ. Kama o toro gọọmenti Anambara steeti maka ọrụ ha bidoro ozigbo ebe ahụ iji hụ na e kpochiri ya bụ olulu kewara ụzọ ha. N'akụkụ nke ya, kọmịshọna na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti bụ michael Okonkwo kwuru na ha na-etinye uchu ịhụ na e meziri ụzọ ahụ ka ụgbọala nwee ike na-aga na ya. O kwukwara na ha na-eti mkpu ka ndị mmadụ kpachara nya maka oke mmiri ozuzo na-abịa nakwa ide mmiri ebe o kwuru na ha na gọọmenti etiti nakwa ụlọakụ mbaụwa na-ejikọ aka ọnụ ịhụ na e lebara anya na nsogbu mbuze na idemmiri na-eme na steeti ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51874219,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51874219,Chike Obi: Odogwu Igbo ji 'mathematics' rie amusu,Ọ ga-ara ahụ ịhụ onye Igbo ọbụla na-anụbeghị maka Chike Obi,"Chike Obi Ma na Naịjirịa ma na mba ụwa niile, aha Chike Obi na-ada ka mkpọnala oge ọbụla a kpọrọ ya. N'ala Igbo, onye chọrọ igosi na ọ maka akwụkwọ, ndị mmadụ ga-ajụ ya sị ""ị ma akwụkwọ karịa Chike Obi?"" Ihe e ji mara odogwu Igbo a bụ mgbakọ na mwepu nke Bekee kpọrọ 'mathematics'. N'ụbọchị Fraịde, abalị iri na atọ nke ọnwa Maachị ka o mere afọ iri na abụọ dike Igbo a lara mmụọ. Onye bụ Chike Obi Chike Obi A mụrụ Chike Obi n'ọnwa Eprel afọ 1921. Nna ya bụ onye Ọnịcha ebe nne ya bụ onye Asaba. Chike Obi gụrụ akwụkwọ elementịrị na Zaria, dị na Kaduna steeti ugbua, n'afọ 1933. Akwụkwọ Sekọndịrị ya bụ na CKC Ọnịcha nke ọ gụchara n'afọ 1939. Chike Obi gụrụ akwụkwọ na CKC nke ọnịcha Ọ banyere 'Yaba Higher College' dị na Legọs n'afọ 1940 Ebe ahụ ka ọ nọrọ gụọ ma nwetakwa nzere B.Sc nakwa M.Sc na 'mathematics' nke Mahadum London n'afọ 1946 na 1947. N'ọnwa Septemba afọ 1947, Obi banyere ụgbọmmiri gawa obodo Southampton nke mba Briten ịga gụọ akwụkwọ ineta nzere Ph.D. O nwetara nke a n'afọ 1950 Nkuzi Chike Obi Chike Obi ji 'maths ata atụ ụtụtụ Chike Obi nọrọ nwa obere oge n'ụlọakwụkwọ 'Massachusetts Institute of Technology' nke mba Amerịka. Ọ kuziri na Mahadum Ibadan bido na 1959 ruo 1970, nakwa Mahadum Legọs bido 1971 ruo 1985. O mechara mepee ụlọọrụ nnyocha a kpọrọ 'Nanna Institute for Scientific Studies' n'Ọnịcha. Ụfọdụ na-ekwu na Chike Obi rụtara 'maths' a kpọrọ 'Fermat's last theorem'. Mana ndị ọzọ na-ekwu na ọ rụtachaghị ya. Ezinụlọ ya Mustafa Chike-Obi bụ nwa nke abụọ ọkammụta Chike Obi mụrụ. Obi lụrụ nwunye ya bụ Belinda Nwanyife n'afọ 1953. Ha mụrụ ụmụ anọ. Iji gosi nkwenye ya n'ịdịnotu Naịjirịa, Chike Obi gụrụ ụmụ ya abụọ aha Yoruba na Hausa. Nke nnukwu bụ Balogun ebe nke na-eso ya bụ Mustafa. Mustafa gwara BBC Igbo na nna ya hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu. Ndọrọndọrọ ọchịchị Nnamdi Azikiwe hibere otu ndọrọndọrọ bụ National Council of Nigeria and Cameroon (NCNC) ebe Chike Obi hibere nke a kpọrọ 'Dynamic Party'. Otu abụọ a mechara jikọọ ọnụ. Chike Obi so na ndị mbụ malitere ime ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. N'afọ 1951 ka o bidoro otu ndọrọndọrọ a kpọrọ 'Dynamic Party'. Otu a mechara sonyere otu NCNC nke Nnamdi Azikiwe bidoro. Oge Naịjirịa nwere onwe ya n'afọ 1960, Obi bụ otu onye n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa anyanwụ. Ọtụtụ oge ka e jidere Chike Obi ma tụkpuo ya na mkpọrọ n'ihi mbọ ọ na-agba ịkwalite ọdịmma ndị Igbo. Oge agha Bịafra malitere, Chike Obi na Odumegwu Ojukwu rụkọrọ ọrụ ruo mgbe agha biri. Ọ bụ eziokwu na Chike Obi alaala mmụọ, mana ike ọ kpara ka na-ada ụda n'ụwa niile. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Onweghị ụzọ ọzọ e si enweta ego na-abụghị ịrụsị ọrụ ike'" egwuregwu-49924873,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49924873,Salwa Eid Naser: Nwa afọ a gbajọrọ Nigeria ga tụtara Bahiain ugo ọlaedo n'asọmpị IAAF,Ọbụghị Salwa Eid Naser ka nne na nna ọgbọsọ a dị afọ 21 kpọrọ mgbe amụrụ ya.,"Nwa agbọghọ a gbafere Miller-Uibo ma merie asọmpị ọsọ 400m nke ụmụnwaanyị na ""IAAF World Athletics Championships"" nke 2019 bidoro ndụ ka Ebelechukwu Agbapuonwu. Nwa ada Naser na-agbaburu Naịjirịa ọsọ tupu o nyefe nkwado ya mba Bahrain. Ka o meriri unyaahu, ọ sị; ""Nke a na-agbaka isi! ""Ọ bu sọso olilanya ime ọfụma mana ugbua atụọla m ugo."" N'afọ 2017 Naser ritere ọra nchara na IAAF agbara na London. Mgbe ahu ọ sị na ya enweghi ihe o ga-agwa ngalaba na-ahụ maka ndi ọgbọsọ na Naịjirịa. IAAF vs AFN: 'Ka ego a si gaa mgbe m na-arụ na AFN'- Thomas" egwuregwu-50976255,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50976255,Liverpool F.C: 2020 ọ ga-abụ afọ ha ga-emecha metụ iko Premier League aka?,Ọ dị ka afọ 2020 a ga-abụ afọ Liverpool ga-emechi ndị na-akọ ha ọnụ maka ebuteghi iko Premier League.,"Ọ bụrụ na a mụrụ gị n'ihe dị ka site n'afọ 1989/90 ruo ugbua, mara na gị na mgbe ikpeazụ Liverpool metụrụ iko Premier League aka, bụ ọgbọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na ikpeazụ otu egwuregwu a buliri iko a, bụ afọ iri atọ gara aga (1989/90). Ka a kwụ ugbua na tebulu Premier League, Liverpool chị ezigbo ọkụ bịa n'afọ 2019/2020 a, makana ha emeriela egwuregwu 19 n'ime 20 ha gbarala. Ebe ọ fọrọ egwuregwu 18 tupu afọ a emechie, ha mere etu a na-aga n'ihu, enweghị ihe ga-egbochi aka ha ibuli iko a. Ha enwetala pọịntị 58, ebe ndị na-eso ha n'azụ bụ Leicester City nwere pọịntị 45; nke bụ na ọ bụ pọịntị 13 ka Liverpool ji aga ha. Ọ bụ ọgwụ ka e mere ha ya eme? Ọ bụrụ n'ajụjụ a na-anụ gị ọkụ n'obi, i fughi ụzọ, n'ihi na ọ bụkwa ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ gbasara ihe mere na Liverpool ebutebeghi iko a. Mana ọ bụ na ha erubeghi nso imetụ ya aka? Ha agbalịala ibute ya bụ iko, mana iko ahụ na-eme ha ọnọ nso eru aka. Ugboro ole ha ruru nso ibute iko Premier League Ugboro ugboro ka Liverpool ruru nso imetụ iko a aka, nke kacha nso abụrụ n'afọ 2018/2019 mgbe Manchester City ji naanị otu pọịntị gafee ma pụchara iko ahụ n'ụbọchị ikpeazụ a pịachiri asọmpi Premier League nke afọ ahụ. Ha ruru nso imetụ iko a aka n'afọ 2013/2014, mgbe Manchester City napụkwara ha nri n'ọnụ. N'afọ 2001/2002, ha ruru nso ibute iko a, mana Arsenal buliri ya bụ iko ebe Liverpool gbara ndị nke abụọ. Otu ihe ahụ mekwara n'afọ 2008/2009, mgbe Manchester United ji naanị pọịntị anọ gafee ha ma bulie iko. N'afọ 1990/1991 ka ha rukwara nso ọzọ ka ha mabutechara ya bụ iko n'afọ 1989/90, mana Arsenal bụ ndị bu Iko ahụ laa. Liverpool buliri iko Champions League ọzọ n'afọ 2018/2019 Iko ole ha buterela n'ime afọ 30 a: Na ha ebutebeghi iko abụghịkwanụ na ha gba aka iko n'ime afọ iri atọ a (site n'afọ 1990 ruo 2019). Lee ndị ha butenwuru: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa" afirika-55808004,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55808004,Death by exercises: Ị ma na o nwere mgbe 'exercise' nwereike idula gị mmụọ?,"Imegharị ahụ kwa mgbe, bụ nke bekee kpọrọ 'regular exercise' bụ otu ụzọ e si ewulite ahụike.","Oge ị na-eme exercise, gbado anya ka ị mata oge ahụ gị chọrọ ịgbanwe ka ị kwụsị. Mana ị ma na enwere mgbe ya bụ 'exercise' nwere ike idula mmadụ mmụọ? Amanda Oru bụ onye na-eme ejije Nollywood, kọrọ akụkọ etu o si nwee ihe ọdachi oge o mechara 'exercise'. N'abalị anọ nke ọnwa Jenụwari ka Amanda mechara 'exercise' nke ọ na-eme kwa mgbe, o teghi aka ọ daa. Oge ọ dara, ọ kụrụ isi n'ala, kupee eze ya, egbugbere ọnụ ya agbawaa, ọ makwaghị ebe ọ nọ ma ncha. Ndị nọ nso oge ya bụ ihe mere gbatara nyere ya aka ma buru ya gaa ụlọọgwụ. E ji eriri pụrụ iche kee eze Amanda n'ụlọọgwụ n'ihi ada ọ dara oge o mechara 'exercise' Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Amanda kwuru sị: ""Ekele dịrị Chukwu na ọbụghị naanị m nọ oge ihe a mere, nke ka njọ gaara ime."" Mana Amanda kwuru na oge ọ garuru ụlọọgwụ, dọkịta nyochara ya mana ọ rara ha ahụ ịkọwacha ihe kpatara ya bụ ihe. O kwuru sị: ""Dọkịta kwuru na shuga dị n'ọbara m dị mma, amaghịzi m ihe kpatara nke a."" Mgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala Otu nwaada ọzọ aha ya bụ Chioma, kọkwara akụkọ etu otu onye agbataobi ya si daa dịka ọ gbachara ntakịrị ọsọ ụdị nke bekee na-akpọ 'jogging'. ""Tupu e buru nwoke ahụ ruo ụlọọgwụ, ọ bụrụ na ọ laala mmụọ,"" Chioma gwara BBC. Ihe nwere ikeime ka ajụ butuo mmadụ oge ọ na-eme 'exercise' Ọ dị mkpa na ị naghị eme 'exercise' naanị gị, ọ ga-abụ ihe dị njọ ka ndị mmadụ gbatara gị ọsọ enyemaka Dịka ndị ọkachamara si kwuo, ọtụtụ ihe nwere ike ime ka ajụ butuo mmadụ dịka ọ na-emegharị ahụ. Ọ bụrụ na-akpachapụghị anya, ya bụ ihe nwere ike kawanye njọ maọbụ metụta etu obi mmadụ si akụ. Nke a nwere ike ibute ọnwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ enwetaghị enyemaka n'oge. Ihe nwere ike ibute nke a gụnyere: Mara ole ahụ gị ga-ebuli. I metụ 'exercise', i zutukwa ike Ihe ndị ọzọ nwere ike ịnọchị anya 'exercise' Ịgba egwu bụkwa ụzọ i nwere ike iji na-eme exercise Imegharị ahụ dị oke mkpa mana ọ bụghị iwu na ọ ga-abụrịrị n'ụdị ịgba ọsọ, maọbụ ibu igwe na-anyị arọ. Lee ihe ndị i nwere ike ị na-eme dịkwa ka 'exercise' nke ga-enyere gị aka: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55616758,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55616758,Coronavirus Second Wave: Lee atụmatụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ tinyere iji gbochie mfesa ọrịa nke abụọ,"Ndị butere nje coronavirus na Naịjirịa agafeela mmadụ otu narị puku (100,000) ugbua.","Okezie Ikpeazu (Gọvanọ Abia Steeti), Willie Obiano (Gọvanọ Anambara steeti), Hope Uzodimma (Gọvanọ Imo steeti) Ihe karịrị mmadụ otu puku (1024) ka nnyocha gosiri na ha butere nje covid19 na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde, dịka ngalaba 'National Centre for Disease Control' (NCDC) si gụpụta. O teela ndị ọkachamara n'okwu ahụike ji ama ọkwa na ọrịa coronavirus ga-amalitekwa ifesa ọzọ, ya bụ ihe ebidola na Naịjirịa ugbua. Ụfọdụ steeti na Naịjirịa etinyekwala iwu dị icheiche iji belata mfesa nke abụọ a. Legọs steeti amachiela nnukwu ọgbakọ ndị mmadụ ma belatakwa ọgbakọ okpukperechi. Ekiti steeti ehiwela mmachi ngagharị n'abalị ma kagbuo ọgbakọ ọbụla karịrị mmadụ iri abụọ. BBC kpọtụụrụ steeti niile dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ iji chọpụta njikere ha dị, lee ihe ha gwara anyị: Abia steeti Iyi mkpuchi imi bụzi iwu n'Abia steeti ugbia, dịka Gọvanọ Okezie Ikpeazu si kpuchie nke ya na foto a Kọmishọna mgbasa ozi n'Abia steeti bụ John Okiyi-Kalu kwuru na ha emeela mkpuchi imi ka ọ bụrụ iwu na steeti ahụ niile. O kwukwara na gọọmentị emepeela nke bekee kpọrọ 'sample collection points' n'okpuru ọchịchị niile na steeti ahụ ka o wee dị mfe ime nnyocha maya bụ ọrịa. 5G and Coronavirus: 5G ọ na-ebute coronavirus? Okiyi-Kalu kwuru sị: ""Ọ bụ eziokwu na ụlọakwụkwọ dị na steeti anyị ga-amalite agụmakwụkwọ ọzọ taa, anyị etinyela ihe niile dị mkpa iji chekwaa ụmụakwụkwọ anyị."" ""Anyị nwere obere ụlọọgwụ n'ụlọakwụkwọ ọbụla iji dopu nwata akwụkwọ ọbụla na-arịa ọrịa iche tupu ụgbọala ahụike abịa buru ya gaa ụlọọgwụ."" ""Ikpuchi ihu bụkwa iwu n'ụlọakwụkwọ niile."" Okiyi kwukwara na gọọmentị emeziela ụlọọgwụ ndopu iche (isolation centres) dị na steeti ahụ, ebe e nwere ohere ga-anabata ihe ruru mmadụ narị abụọ ugbua. Anambara Steeti Kọmishọna ahụike n'Anambra steeti bụ Vincent Okpala (kpu okpu mmeemmee) kwuru na ha enyela ọtụtụ mmadụ ọzụzụ gbasara mgbochi covid19 Kọmishọna ahụike n'Anambara steeti bụ Vincent Okpala kọwara na ihe kacha kpalite mfesa nke a bụ maka ndị njem sigasị mba dị icheiche bata. Okpala gara n'ihu kwuo na gọọmentị amalitekwala mgbasa ozi siri ike iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị. Coronavirus Tips: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus? O kwuru sị: ""Anyị agaala n'ọdọ ụgbọala, ahịa, nakwa ụlọụka dị icheich iji nye ndị mmadụ ọzụzụ maka ichekwa onwe ha."" ""Anyị adọkwaala aka na ntị na gọọmentị nwere ike imechi ahịa maọbụ ụlọọụka ọbụla ebe ndị mmadụ anaghị eme ihe ha kwesịrị ime."" ""Ọzọkwa bụ na mkpuchi ihu bụ iwu n'ụlọọrụ gọọmentị ọbụla, onye eyighi ya agaghị enwe ike ịbata."" Mana Okpala kwuru na nchekwa onwe bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, ""maka na a ghara ndụ kpaa akụ, onye iro erie ya"". Kọmishọna ahụike nke Enugwu, Ebonyi nakwa Imo steeti azaghị oku anyị kpọrọ ha, mana kọmishọna mgbasaozi Imo steeti kwuru ka a kpọghachi ya azụ. Zọba isi onwe gị Covid-19 n'otu nkeji: Facemask ọ na-egbochi mbute coronavirus? Vincent Okpala bụ kọmishọna ahụike na Anambra steeti kwuru na ""ihe kacha mkpa bụ ka onye ọbụla kpachapụrụ onwe ya anya."" Ụzọ mmadụ ga-esi na-echekwa onwe ya gụnyere: Iyi mkpuchi ihu, ịkwọcha aka oge niile, izere ọgbakọ nnukwu mmadụ, ịnọte ndị mmadụ aka nke bekee kpọrọ 'social distancing'. Ugbua abụghị oge ndị mmadụ ji arụ ụka ma coronavirus ọ bụ eziokwu ka ọ bụghị. Onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ ga-aracha ya. Ukpana okpoko gburu, ntị chiri ya.""" afirika-50259685,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259685,Igbo Marriage: Mgbe nwoke kwesiri ikuchi nwaanyị,Ndị Igbo anaghị eji alụm dị na nwunye na ụmụaka egwu egwu ọkachasị nwa nwoke.,"Nganga nwoke mgbe ochie bụ ọba ji ya na etu ezinụlọ ya si jupụta n'ụmụaka. Nwoke mụbara amụba na-ahụ onwe ya dịka nwoke zuru oke. Agbụrụ mmadụ bụkwa ihe ọzọ dị ndị Igbo mkpa. Onweghị onye chọrọ ka ama nna ya chie nke mere na nwoke ga-agbalị lụọ nwaanyị ma kpewere chi ya ka ọ mụọ nwa nwoke. Nke a mere e ji atụ ilu sị na onye nwere mmadụ ka onye nwere ego. Kedu mgbe nwoke ga-ekuchi nwanyị? Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile Duke Olueze Ukeje, nwaafọ Nwangele nke dị n'Imo steeti, kọwaara BBC ihe bụ ikuchi nwaanyị. O kwuru sị na mgbe dị nwaanyị nwụrụ, ma ha amụtara nwa ma ha amụtaghị nwa, a na-ajụ nwaanyị ahụ ma ọ chọro ị nọ ka ọ chọrọ ịla be nna ya. Ọtụtụ mgbe, nwaanyị ahụ na-ekweta na ọ ga-anọ na be dị ya. Mgbe ọ dị otu a, ọ bụ nwanne di ya ga-ekuchi ya. Otu ihe ọzọ dịkwa mkpa bụ na nwoke agaghị ekuchi nwunye nwanne ya nke ọ tọrọ. Ọ bụ nwanne ha nke nta ga-ekuchi nwunye nwanne ya. Mana gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na onye nwụrụ anwụ enweghị nwanne nwoke ọ tọtara? Dịka Ukeje si kwuo, mgbe ihe dapụtara otụ a, ọ bụrụ na ọpara amụtabeghị nwoke topụtara etopu, ọ diziiri ya ikuchi nwunye nwanne ya. Mana ọ bụrụ na ọmụtala nwoke topụtara etopu, mara na ọ bụ nwa ya ahụ ga-ekuchi nwunye onye nwụrụ anwụ. Kama ọ bụrụ na-enweghịzị nwoke fọrọ n'ezinụlo ha, nwanna ha bụ otu agbụrụ ga-ekuchị nwaanyị ahụ. Kedu onye ụmụ amụtara site na-ikuchi nwaanyị ga aza aha ya? Ihe mere anyị ji nọruo afọ 40 tupu anyị agbaa akwụkwọ Ukeje gwara BBC Igbo na ọ bụ aha nwoke nke nwụrụ anwụ ka ụmụ amụtara site n'ikuchi nwaanyị ga-aza. Nwanne nwoke onye ahụ nwụrụ anwụ ga-ewere mmanya gaa na nke ndi ọgọ ya gwa ha na-ọbụ ya ga-elekọta nwa ha nwaanyị. Ụmụ amụtara ga-azazị aha nwoke nke nwụrụ anwụ. Mana nwanne ya nwoke nwere ịke ịga lụgharịa nwunye nwanne ya ahụ. Ọ bụrụ na nke a mee, ụmụ ha mụtara ga-aza aha ya. Kedu ebe ụmụ amụtara na-ikuchi nwaanyị ga-ekete ọke? Marriage: Ị ga-agwa di maọbụ nwunye gị ego ole ị na-akpata? Ụmụ nwoke onye nwụrụ anwụ ga-ekete oke n'ụlọ nna ha nwụrụ anwụ. Kama ndị nke amụtara site na ikuchi nwaanyị ga-aza aha onye kuchịrị nne ha ma kete oke n'ama onye kuchiri nne ha. Ọ bụrụ kwanụ nwoke lụrụ ọtụtụ nwunye? Mgbe nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị nwụrụ, ọpara ya ga alụwa ma kuchie nwaanyị ikpeazụ nna ya lụrụ. Kedu maka ụgbụ a? Ọkammụta n'ihe gbasara omenala Igbo bụ Gladys Udechukwu gwara BBC na mgbe ochie, ndị Igbo hụrụ ụmụaka n'anya ọkachasị nwa nwoke. O kwuru na ụgbua, onye na amụtaghị nwa nwoke ma ọ bụ na-amụtaghị nwa ọbụla nwere ike ịga kute nwa n'aka gọọmentị. Nke a bụ nke Bekee na-akpọ 'adoption'. Udechukwu kọwakwara na e nwere atụmatụ sayensị dị na nwunye nwere ike iji mụta nwa nwoke. O kwukwara na ọtụtụ ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ agaghị ekwe ka nwanne dị ha kwuchie ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa" 44693656,https://www.bbc.com/igbo/44693656,#BloodontheFlag: Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa egosila obi mgbawa ha,"Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa apụtala n'elu soshal midia igosi iwe ha gbasara etu ihe si aga na Naịjirịa, ọkachasị ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Platu steeti.","#BloodontheFlag: Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa egosila obi mgbawa ha Ọtụtụ ndị nkiri pụtara na Instagram na-eme ihe onyonyo na-egosi na ihe a nwereike ime onye ọbụla. Ha ji akara #Bloodontheflag nke pụtara ọbara dị n'ọkọlọtọ Naịjirịa wee na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla. Gụnyere ihe onyonyo ha mere, ha na-edepụtakwa etu ọ dị ha n'obi. Nwata nwaanyị so na ihe nkiri Big Brother naija nke afọ 2018 bụ Ifu Ennada tinyere ọnụ n'okwu iwe ndị na-eme onyonyo na-egosipụa n'elu soshal midia etu ihe si aga na Naịjirịa. Stan Nze na-egosi iwe ya Stan Nze dere; ""Anyị ekpela ekpere, anyị ebeela akwa, anyị akwafuola ọbara ndị aka ha dị ọcha, ndị anyị hụrụ n'anya anwụọla ma na anyị na-ekwu na ozugo. ""O ruola oge anyị ga-eme ihe. O ruola oge anyị ga-ekwu okwu. Tinye olu gị taa."" Ọ bụghị naanị Stan Nze na-eme ngosi iwe a, ọtụtụ ndị ọzọ esonyekwala. Onye bidoro ya bụ ngosi iwe aha ya bụ Niyi Akinmolayan gwara BBC na ya chọrọ izigara gọọmenti etiti ozi dị ọkpụrụkpu mere ya jiri bido ya bụ ngosi iwe. Niyi Akinmolayan bụ onye hibere okwu #BloodOnTheFlag Niyi bụ onye na-ahazi ihe onyonyo kwuru na ya gwara ndị nọ n'ihe nkiri ibe ya ka ha gosi foto ha maọbụ ihe onyonyo ha ebe ha ji ihe yiri ọbara iji kwado ezinaụlọ mwakpo mere na Platu steeti metụtara. Ọ gara n'ihu kuzie ndị mmadị etu ha ga-esi mee ya bụ ihe ga-eyite mmeru ahụ n'aka ha. BBC Igbo gbara mbọ inweta onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii bụ Jimoh moshood mana ọ zaghachighi ozi niile anyị zigara ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49525291,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49525291,Luis Enrique na-eru ụjụ maka ọnwụ ada ya,Obi mgbawa na arịrị juru onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique obi ugbua.,"Nke a bụ dịka ọ na-eru ụjụ maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Xana onye nwụrụ site n'ọrịa kansa ka ọ gbachara afọ itoolu. Enrique bụ onye wepụtara ozi maka ọnwụ nwa ya na Twitter na mgbede Tọzde dịka ọ na-ekele ndị ụlọọgwụ nyere aka lekọta nwa n'ọnwa ise ikpeazụ ya. Luis Enrique na nwa ya nwaanyị bụ Xana O kwuru na nwata ahụ ga-abụ ""kpakpando ga-ana atụziri ezinaụlọ anyị."" Enrique kelekwara ndị mmadụ maka nkwado ha. Ka ọdị ugbua, otu dị icheiche etiela Enrique aka n'obi maka ọdachi a dakwasara ezinaụlọ ya. Ha gụnyere UEfa, Manchester United, Laliga wdg." 49592391,https://www.bbc.com/igbo/49592391,South Africa Killing: 'Onweghi ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi' - Ụmụ Igbo,BBC gbara ụfọdụ ụmụafọ Igbo bi na Saụt Afrịka ajụjụ ọnụ maka nkpọlata nke gọọmenti etiti na ụlọọrụ Airpeace na-akwadoro ha site n'iwepụta ụgbọelu ga-ebulata ndị chọrọ ịlọta.,"South Africa Killing: Onweghi ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi Ndị anyị jụru sị na ọ ka bụ n'asịrị ka ha na-anụ maka nke a. Lee akara Twitter ndị Ministri na-ahụ maka mmekọ mba Naịjirịa na mba ndị ọzọ sị kwuo ya; End of Twitter post, 1 Mana ha aghọtabeghi ka ya bụ ihe ga-esi gaa. James Nnoli bi na Johannesburg sị na atụmatụ a mara mma n'ihi na ""E nwere ọtụtụ mmadụ na-enweghi ihe ha na-eme na Saụt Afrịka chọrọ ụzọ ha ga-esi laa mana ha amaghị"". Nnolị kwukwara na ọ ga-achọ ịmata etu atụmatụ a ga-esi aga. Ọ chọrọ ịmata ka o nwere ebe ndị chọrọ ịla ga-aga edenye aha ha, ka ọ bụ ha iburu akpa ha gawa n'ọdọugbọelụ. Ọ chọkwara ịma ka o nwere etu gọọmentị ga-esi nyere ndị ga-alọta aka ka ọ bụ ebulata ha na Legọs, e fere ha aka sị ha laa n'udo. Nnoli sị na ya ebughi n'obi ịga ebe ọbụla maka na o nwere ihe ọ na-eme na Saụt Afrịka. N'uche ya, ""Ọ bụ ndị na-enweghi ezigbo akaọrụ na-akụ mgbanụ ịla Naịjirịa"". N'olu nke ya Ikechukwu Samuel bikwa na Johannesburg sị na onweghi ebe ya na-ala. Ụmụafọ Naịjirịa si Libia Ọ tụrụ ilu sị na ""ọkụkọ chị ụmụ anaghị agba ajọ ọsọ"". O sị na udo dị na mpaghara ha nọ nke bụ na obodo ajụọla oyi ebe ahụ. Ikechukwu sị na ya amakwaghị ndị Naịjirịa chọrọ ịlọta. O sị na ya anaghị atụ anya na otụtụ mmadụ ga-esi otu ahụ laa. Ihe nkiri Rural Electrification: 'Enweghị ọkụ na-ata anyị ezigbote ahụhụ n'Awgu' Akụkọ ga-amasị gị" afirika-49177625,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49177625,Enugu State Tourism: Ihe o ji bụrụ 'baby ọkụ' mma zuru ahụ,Kedụ ihe ị nụrụla maka Enugwu steeti na ndị bi ma si ebe ahụ?,"Ị nụrụ na akpị na-enye ha nsogbu ka ọ bụ na ha enweghi mmiri (inweta mmiri na-ara ha obere ahụ)? Ọ bụrụ na ị nụrụ nke a, ọ bụchaghị asị, mana n'ime ihe ọjọọ ndị ị nụrụla, ị ma ihe ndị mere ka Enugwu bụrụ ""egwu eji""? Lee ihe ndị mere ka Enugwu steeti e ji ""042"" nakwa ""Coal City"" mara bụrụ e jechaa ọ gwụ dịka BBC Igbo chọpụtara: 1) Ebe a na-agbara anya ekeresimesi Obodo a nwere ọtụtụ ebe ọ ga-abụ ị garuo na-ele sọ mma ọ mara, i nwere ike ichefu ihe ndị na-akpagbu gị, ọ bụrụgodu nwa mgbe nta. Ị nụla maka ""Miliken Hill""? Ebe ụzọ e si aga ya dị n'elu ugwu ma rọgọọ arọgọ, na-atụ ụjọ ma buru ebube ga-amasị gị? Kaọbụ ị gaala ""Ngwo pine forest"" ebe ọmalịcha ukwu osisi juru ma ebe mmiri na-esi n'okwute agbapụta? Ikwaiko na nwaanyị nọ na nsọ ya anaghị aba Ọgba Ezeagu Ị tụzịa ụkwụ na ""Nike Lake"" ị gaghị achọ ịla ọzọ. 2) Kpachi kpachi ụgbọala adịghị Ọ bụrụ na i si obodo dịka Legọs steeti abịa, ị gaghị achọ isi Enugwu steeti apụ ọzọ makana ụzọ na-aga siriri werere. Kpachi kpachi ụgbọala abụrụla njirimara Legọs adịghị ebe a; i nwere ike igaru ebe niile na-amasị gị ma lọtakwa n'oge. 3) Ndị isi a hụrụ kwaba okpu na ndọrọndọrọ ọchịchị: E kwuo maka Enugwu steeti ma ghara ịkpọta aha ndị mere ka a nụ aha ndị Igbo na Naịjirịa, e bidola ya bụ okwu kwanụ? Ndị dịka Jim Nwobodo, Christian Onoh, Ken Nnamani chịrị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa nakwa Ike Ekweremadu bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu so na ndị a ga-akpọrịrị aha ha. Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata 4) Nri E ji ọkpa mara ndị Enugwu, mere ka ha bụrụ ndị mbụ ga-agbata gị n'uche ma ị nụ maka ọkpa Ọ bụrụ na ị ribeghi ọkpa Waawa maọbụ nke 9th Mile, kedụkwanụ etu ị ga-esi ekwu na ị bụ ""ori ọkpa""? Nri ọzọ e ji mara Enugwu steeti bụ ""Abacha"". Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị Abacha a na-agwọ n'Enugwu bụ rie ma rachaa efere taa ngaji. Azụ, kanda, ihe niile a na-etinye n'ime ya bụ ihe ga-eme ka ị na-agụ asọmmiri ma ị cheta ya. 5) Emume Obodo niile nwere emume si n'omenala mana nke ndị Enugwu steeti pụrụ iche. Emume dịka Odo, ịgba mmọnwụ Coal Camp nke Obiagụ, emume Atama, Ọkpụkpụ ụzọ nakwa Ọrụrụeshị bụ maka iri ji ọhụrụ wdgz. Odo festival: Otu ndị Nkwo n'Enugu steeti si eme oriri Odo Ị nụkwala maka emume Ịgwa Nshị nke a na-ejikwa ọkpa eme? Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ. 6) Ahịa Ị garugo Enugwu ma ị nụbeghi maka ahịa Ọgbete, Kenyatta nakwa Orie Orba bụ ebe ndị si ugwu Awụsa na-abịa ebusa ma ree ahịa ha? Mmepụta mmanụ n'akị 7) Ọnatarachi Kedụ ebe e si enweta ""coal"" e ji akwanye ọkụ latrik nakwa ""cashew"" a na-ere were ego si na ya nyere ndụ aka? A na-ere Kashụụ n'okporo ụzọ Naịjịrịa 8) Mahadum Mahadum bụ ihe mara ha ahụ n'obodo a; ọ dị ka ebe ọbụla ị tụgharịrị ị na-ahụ sọ mahadum mahadum. Ndị dịka University of Nigeria, Nsukka (UNN), Enugu state University of Science and Technology (ESUT), Institute of Management and Technology (IMT), Renaissance University, Osisatech University, Godfrey Okoye University nakwa Caritas University. E jikwa ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH) na-anụ aha Enugwu steeti. Kedụ ihe ndị ọzọ ga-eme ka ị gaa Enugwu steeti? Ihe nkiri a ga-amasị gị: 'Ekwere m na 'One Nigeria' ma ụmụ Igbo gaanụ mepe ala Igbo'" 49676987,https://www.bbc.com/igbo/49676987,Uzọma Asagwara: Ihe ise ịmaghị maka nwa ada Igbo a,Nwafọ Igbo ọzọ achakeela n'ala Bekee mgbe o nwetara mmeri dịka onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Manitoba na mba Kanada.,"End of Twitter post, 1 Uzoama, onye otu pati NDP(New Democratic Party) so na ndị isiojii atọ banyere ụlọomeiwu mpaghara ahụ kemgbe afọ 150. Lee ihe ise ndị ọzọ ị maghị maka nwa ada Igbo a: 1. Tupu o nweta oche dịka omeiwu, Asagwara bụ onye nọọsụ nlekọta ndị na-arịa isi na uche doro anya 2. Nwada Igbo bụ onye ụmụahịa, Abịa steeti bụ onye a mara dịka onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye. 3. Nna ya bụ KC Asagwara bụ onye nkuzi a ma ama na mba Kanada. 4. O bụ onye na-akụburu mba Kanada 'Basketball' 5. Uzoma gbara naanị afọ 25 Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọkwa ọhụrụ Uzoma banyere na ya: @FBanks7 kwuru na ada igbo mara mma abanyela n'ụlọomeiwu Manitoba na Canada. @OmayraIssa kwuru na nke a bụ nnukwu ihe n'ihi na o mere na mpaghara ebe ndị isi ojii enweghị ọnụ okwu." afirika-48270052,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48270052,Building collapse: Ụlọ adagbuola nwaokorobịa n'Enugwu,Ihe ịgba anya mmiri mere n'Idaw River Enugwu ebe ụlọ a na-arụ arụ dagburu otu nwa nwoke na-enyere aka na ya bụ ọrụ.,"Chidera Odoh, onye gbara afọ iri abụọ na otu nọ na okpuru ụlọ ahụ arụ ọrụ ya, oge ozere ma dagbuo ya. Ndị gburu gburu Ikirike village n'Ijwa Idaw River gbara mbọ ịdọpụta ya bụ nwatakịrị na ndụ mana okweghị ha. Ndị otu SEMA, NEMA, REDCROSS na ECTDA butere ụgbọala 'caterpillar' na ngwaọrụ ha ndị ọzọ wee nyere aka gbarie nnukwu okwute tupu a dọpụta ozu ya bụ nwaokorobịa. Onye isi ndị NEMA ngalaba nke Enugwu bụ Fred Aṅụsim kwuru na odoro anya na ọbụ ụlọ adigboroja ka onye nwe ya bụ ụlọ na arụ wee kwee nkwa na ndị ụlọ ọrụ ya ga-enyere aka nwude onye nwe ụlọ nakwa Engineer na-arụrụ ya ụlọ ka ha kọwaa ụzụ kuziere ha ịkpụ ogene. Ndị ọrụ gbatagbata nyere aka gbapúta ozu nwokorobịa ahụ Onye nnochite anya SEMA n'Enugwu bụ Nkechi Eneh Kwuru na ya ga-eme nchọpụta ihe mere ya bụ ụlọ ana-arụ arụ jiri daa. Nchọpụta gosiri na ya bụ nwa okorobịa nwụrụ anwụ Chideraa Odo gbara afọ ihe dịka iri abụọ na otu, nna ya bụ onye uweojii lara ezumike nka, ebe ha bị na Police detective college Enugwu. Ndị agbata obi ya na police barack kwuru na nwatakịrị ahụ na-agba mbọ nke ukwuu nke na ọ na aga eso arụ ụlọ were na enweta ego oji enyere onwe ya aka ma na akwadobe ide Jamb. Nwa nne ya nwaanyị kwuru na Chideraa dịka olileanya ezinaụlọ ha were kwuo na ha dịzị ka ndị ọkụ ha nyụrụ n'ike. Anyị enweghị ike ịgba nne na nna ya ajụjụ ọnụ n'ihi na ibe akwa na iru uju karịrị ebe ahụ. Mazị Tim Adibe bụ onye agbataobi ya ụlọ dara ada kpọkuru ministri gọmenti Enugwu steeti ọ dị na-aka ka ha na enyocha ụlọ ọbụla a na-arụ ọhụrụ iji mata ma ha esoro ihe iwu ịrụ ụlọ kwuru. Adibe onye kwuru na ya bụ onye otu ndị Engineer kwuru na ọ bụ iji akụrụngwa adigboroja nakwa iji Engineer adịgboroja rụọ ụlọ na-ebute ụlọ ida ada ma dagbuo mmadụ. Ihe ịgba anya mmiri mere n'Idaw River Enugwu ebe ụlọ a na-arụ arụ dagburu otu nwa nwoke na-enyere aka na ya bụ ọrụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52476158,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52476158,Indaboski Bahose: Ihe iri ọtụtụ mmadụ amaghị maka Odumeje,"Ị jụọ ọtụtụ ndị mmadụ onye ụkọchukwu aha ya kacha ewu ewu na Naịjirịa ugbua, onye mbụ ị ga-anụ aha ya bụ Odumejeje.","Chukwuemeka Ohanemere Chukwuemeka Ohanemere bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry' dị n'Ọnicha, Anambra steeti. Odumejeje bụ ụkọchukwu ma bụrụkwa onye otiegwu. Egwu ya agasaala ọtụtụ steeti na Naịjirịa. Aha a na-etu ya buru ibu nke gunyere: 'Lion', 'Liquid Metal', 'Indaboski Bahose' dịrị gawa. Otu onye ma ya ọfụma na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka odogwu nwoke a: Chukwuemeka Ohanemere onye e ji Odumejeje mara Ihe mere Odumejeje ji ewu ewu ugbua Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Odumeje na soshal midia Mahadum 'Gregory University' nyere Odumeje nzere 'doctor of humanity' Ụfọdụ na-ekwu na onye chọrọ obi aṅụrị gakwuru Odumeje Ndị ọzọ na-eto ya maka ụkwụ egwu ya" afirika-45207602,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45207602,Abuja: Etu otu nwoke siri gbalahụ ọdachi ụlọ elu dara,Otu onye ọrụ so arụ ọrụ ebe ahụ ụlọelu ana arụ arụ dara n'Abụja kọwara na ọ bụ oge ya gbadara ala ibute aja ibugo elu ka ya hụrụ n'ụlọ ahụ n'ada nke nyere ya ohere ịgbapụ ọsọ ndụ.,"Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ amaghị arụ butere ọdịda ụlọelu ahụ Nwoke ahụ a kpọrọ Usman Abdullahigwara BBc sị, ""Ana m achọ ịgbago elu oge m hụrụ ka ụlọ gbawara na-achọ ịda, m were tipụ ọsọ."" Agbanyehị na Abdullahi zọtara ndụ ya, ọtụtụ ndị ya na ya na-arụ ọrụ ka tọrọ n'okpuru ụlọelụ ahụ dara na Jabi dị n'Abuja n'ụbọchị Fraide ma tigbuo mmadụ abụọ. Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agalarịi ebe ahụ ihụ ihe mere ma tie ndị ihe mere aka n'obi. Osinbajo kwuru na afọ juru ya maka ọrụ gbatagbata a na-arụ ebe ahụ. Osinbajo kwuru na o nwere olileanya na aga-agbapụta ndị ka tọrọ n'okpuru ụlọ dara nụ Osinbajo kwuru na o nwere olileanya na a ga-agbaputa ndị niile ka tọrọ n'okpuru ụlọ elu a. Ụlọ ọrụ ndị gbatagbata a kpọrọ 'FERMA' kwuru na agbapụtala mmadụ isii,mmadụ ise agaala n'ụlọ ọgwụ Asokoro ebe otu onye nwụrụ. Minista na-ahụ maka FCT biara ebe ihe a mere Mberede a e butela nnukwu ahịrị ụgbọala makana ndị mmadụ gbakọtara ebe ahụ na-ekiri mkpa mkpa a kparanụ. Ụlọ a dara ada dị nso ụlọahịa a kpọrọ ""Panda Shopping Mall."" Ihe ndị ọkachamara kwuru Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na ihe karịrị mmadụ iri ka tọrọ n'ụlọ elu ahụ dara ada. Ndị gbata gbata na-agba mbọ ị gbaputa ndị mmadụ ka tọrọ n'ụlọ a dara ada. Ndị kara mara na-ekwukwa na-arụzighị ụlọ ọfụma nke mere o ji wee daa. A rụrụ ụlọ ahụ ihe karịrị afọ iri gara aga mana ihe ruru ọnwa atọ gara aga, e bidoro ịrụkwasa ụlọ n'elu ya. Onyeisioche FCT na-ahụ maka ụlọ obibi kwuru na arụzịghị ụlọ ahụ dịka o kwesiri. Ndị ọrụ n'ụlọ elu a aka na-arụ arụ nakwa ndị na-ere ahịa mbụgharị ka tọrọ n'ime ya bụ ụlọ elu. Ndị akaebe na-ekwu na ihe kariri mmadụ 50 na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ Ndị ọrụ gbatagbata ka nọ ebe ahụ na-agba mbọ ị gbapụta ndị ka tọrọ n'ụlọ ahụ dara ada. Ebugala ndị meruru ahụ na mberede a ụlọọgwụ. Onye gbara ọsọ ndụ mgbe ihe mere kwuru na ihe ruru mmadu iri na ise na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ. N'ọnụ ya,"" ụlọ a anọọla afọ asaa ebe a."" Mmiri ozizo chụsasiri ndị mmadụ gbakọtara i kiri ihe na-eme ebe ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 49605108,https://www.bbc.com/igbo/49605108,Robert Mugabe bụ oke osisi n'Afrika' - Emeka Anyaoku,"Dịka anya mmiri juru mba Zimbabwe na mba Afrịka anya taa maka ọnwụ Robert Mugabe, onye Igbo ji aga mba bụ Emeka Anyaoku ebela akwa maka ya bụ oke osisi mba Afrịka dara n'ụtụtụ Frịde.","Robert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ Anyaoku sị ""na-ekwesiri ịcheta Mugabe dịka oke osisi mịrị ezi mkpụrụ na mba ya bụ Zimbabwe, agbanyeghị na osisi ya malitere ịmị ajo mkpụrụ n'ikpeazu"". Anyoku sị na ya matara Mugabe mgbe ọ nọ n'isi ọgụ nnwereonwe mba Zimbabwe n'aka ndị ọcha mgbe mba ahụ na-aza Rhodesia na 1980. Okwuru na Mugabe ebughị ajo ihe n'obi mgbe ọ napatara obodo ya n'aka ndị ọcha, mana na ọtụghị anya ihe pụtara na ya bụ okwụ. Robert Mugabe 1924 - 2019 Nke a mere Anyoku jiri dọọ ndị ọchịchị mba Afrịka aka na ntị sị ka ụzụ ga-akpụ ogene lee ya bụ egbe anya n'ọdụ ọkachasị n'okwu gbasara ala gbasara ndị ọcha. Ọ dọsiri aka na nti ike si atụrụ ga-epu mpi, ekwo kakwaa ya aka. A maghị ma a ga-anwuchị Grace Mugabe O kwukwara na n'ezie na Mugabe malitere ọchịchị ya nke ọma na 1980, mana na ọ bịaziri wee ka onye nwenụ ma. Ọ sị na ọbụrụ na Mugabe pụrụ mgbe ekwụ ka dị ọkụ, na ihe mere ya agaghị eme ya. Ọ sịkwa na oke ọchịchọ nwụnye ya bụ Grace Mugabe, dịka ọ nụrụ, so gbachapụ ya ọkpa n'ala. Anyoku bụbu odeakwụkwọ ukwụ nke ọgbakọ ""Commonwealth of Nations"" kwuru na agbanyeghị na a sị na nwunye ya nwere aka na ọdịda ya, mana ya ga-echeta Mugabe dịka dike maliri ka agụ, ma wụọ chọm n'ala ka nwa awọ. Ihe ndị ọchịchị ndị ọzọ Joseph Kabila sị na agaghị echefu Mugabe echefu n'ihi na ọ bụ onye gbataara ha ọsọ enyemaka mgbe ha na Bekee na-alụ. Ọ sị na mba Afrịka etufuola dike n'agha nnwereonwe. N'otu aka ahụ kwa, Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyetta enyelarị iwu ka gọọmentị ha tọtuo ọkọlọtọ ha mkpirisi maka iru uju n'ọnwụ Mugabe. Raila Odinga bụ onyeisi patị anọghị n'ọchịchị na Kenya hụtara Mugabe dịka dike zọpụtara ndị mba ha ma zohiekwa ụkwụ dịka ndị ọzọ. Mana ọnụ na-ekwuru gọọmentị Briten kọwara Mugabe dịka ọgbatauhie dịịrị ọtụtụ mmadụ. O kwuru na ọnwụ ya ga-ebute mgbanwe na ndụ ndị dị otu a. Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin toro Mugabe dịka dike zọpụtara obodo ya n'aka ọchịchị nchigbu. Ihe nkiri ga-amasị gị: Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya Akụkọ ga-amasị gị" 45911050,https://www.bbc.com/igbo/45911050,New Minimum Wage: Anyi agaghị akwụlị ego opekatampe ndị ọrụ,Ọ dikwa ka ndị ọrụ agaghị ekweta nke a makana ndị gọvanọ ekwupụtala na ha agaghị akwụlị ego opekatampe e wepụtara ọhụrụ.,"Nigeria Governors' Forum bụ otu jikọtara gọvanọ niiloe na-achị steeti 36 di na Naijirịa Cheta na mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige gwara ndị ntaakụkọ n'izu uka garaaga na ndị otu ọrụ na-ekwu ka e nye ha puku naira iri atọ kwa ọnwa. Mana gọọmentị kwuru na ha ga-enye ha puku naira iri abụọ na anọ ebe ndị gọvanọ na-ekwu na ha ga-akwụli naani puku naira abụọ. Mana ka ọ dị ugbua, amabeghị ma ndị ọchịchị otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa a ga-anabata puku naira iri abụọ na anọ nke ndị ụfọdụ na gọọmentị kwekọrịtara. Ihe nke a pụtara bụ na ndị otu NLC akpọọla oku ka ha nwe nzụkọ maka mkpebi ihe ha ga-eme. Ndị ọrụ Naijirịa na-ejị May 1 eme emume mba ụwa niile ji echeta ha. Onyeisi NGF ma bụrụkwa aka na-achị Zamfara steeti kwuru na ndị gọvanọ na onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba nwere mkparita ụka ebe ọ gwara ha steeti ole na ole kwekọrịtara ikwụcha ụgwọ niile ha ji ndị ọrụ steeti ahụ. Mana otu a kpọrọ ""National Economic Council (NEC)"" zụkọrọ ụnyaahụ mana ha akapaghị maka ya bụ mbugo ego ndị ọrụ. Gọọmentị etiti ekwetaghị na ha ga-akwụ puku naira iri atọ dika ego opekatampe. Ndị ọrụ jụkwara nke ha kwetere ịkwụ. Ndị gọvanọ kwukwara nke ha. Ihe ndị mmadụ chọrọ ịma ugbua bụ kedụ nke ndị ọrụ ga-ewe? Cheta na ọ bụ ego ruru naira puku iri ise ka NLC na-ekwu ka a kwụọ ha nke mere ha ji gwa ndị ọrụ ka ha agba abụbụ ọrụ. Akụkọ ga-amasị gị:" 44464811,https://www.bbc.com/igbo/44464811,International Albinism Awareness Day: Lee nke bụ eziokwu na nghọtaghie ị nwere maka anyarị,"N'ụwa niile nke mpaghara Afrịka nakwa Naịjirịa so ya, ndị anyarị na-agabiga ịkpa oke site n'aka ndị dị icheiche maka agwa ahụ ha.","Ịkpa oke a bụ maka na ndị mmadụ chere na ha anaghị acha etu ndị ọzọ si acha, ya bụ ndị dị ọcha maọbụ ndị dị ojii. Ndị anyarị bụ ndị nwere nsogbu dị n'agbụrụ bekee kpọrọ 'congenital disorder' nke na-eme ka ha ghara inwe agwa na-eme ka mmadụ dị ojii maọbụ dị ọcha nke a kpọrọ 'melanin' na bekee. Dịka Dọkịta Chuka Agunwa nke ụlọọgwụ UNTH, Enugwu, siri kwuo, ""Naanị ihe dị iche na anyarị na onye abụghị anyarị bụ na ihe na-eme akpụkpọ ahụ mmadụ adị ojii nke a kpọrọ 'melanin' ha enweghị ya."" Mana agwa ahụ emeghi ka ha kwụsị ịbụ mmadụ nke kpatara ndị mmadụ ji akọ ha ọnụ ma na-eme ha akaja maka ahụ ha. N'ụfọdụ ebe n'Afrịka, a na-eji ha agwọ ọgwụ ma ọ bụ na-egbuchu ha egbuchu maka na a na-eche na ha na-eweta ego maọbụ na ha bụ abụmọnụ. Otu onye anyarị bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Jude Nwabokei gwara BBC Igbo na dịka nwoke, ụfọdụ ụmụnwaanyị ekweghi ka ya na ha nwee mmekọ ọbụla maka etu o si acha. N'okwu ya; ""Eziokwu, ndị m na-arụrụ ọrụ enyela m ohere dịka ha nyere ndị ọzọ ime ihe ọbụla m kwesiri ime mana ọ bụ naanị oge m chọrọ ịlụ nwaanyị ka m nwetara ịkpa oke. Ụmụnwaanyị abụọ m chụrụ achọghị iso m maka na m bụ anyarị."" Ndị anyarị bụkwa mmadụ nwere mmetụta, ọ dị mkpa ịkpaso ha ezi agwa Nghọtaghie na nke bụ eziokwu banyere anyarị E nwere ọtụtụ nghọtaghie gbasara ndị anyarị: 1. Ndị anyarị anaghị eri nnu Dịka Dọkịta Chuka Agunwa nke ụlọọgwụ UNTH, Enugwu, siri kwuo, nke a abụghị eziokwu, o nweghị ihe ha na-asọ. ""Ọ bụghị eziokwu. O nweghị ihe dị iche na anyarị na onye abụghị anyarị. Ahụ ha zuru oke. Ọ bụghị ọrịa."" 2. Ha anaghị ahụ ụzọ n'ehihie Ọ bụchaghị eziokwu. Isi ekpughị ha, kama ndị anyarị anaghị ahụcha ụzọ ọfụma ka ndị ọzọ ma anwụ na-eke. Dọkịta Agụnwa onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ọha, sị: ""O nwere 'pigment' mmadụ na-enwe n'anya dịkwa ka nke a na-enwe n'akpụkpọ ahụ nke bụ 'melanin' nke ndị anyarị enweghị n'uju. Nke a mere na ha anaghị ahụ ụzọ ọfụma ọkachasị ma anwụ na-acha."" 3. Ndị anyarị ezughị oke dịka nwoke maọbụ nwaanyị Dọkịta Agunwa kwuru na ""o nweghị ka onye anyarị siri dị iche na ndị ọzọ dịka n'ịmụta nwa maọbụ ime ihe ndị ọzọ"". Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51848811,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51848811,New Anambra Burial Laws: Ihe 10 dara ụda n'iwu akwamozu ndị steeti a,Kamgbe ụnyahụ bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Maachị ka iwu ọhụrụ nke akwamozu n'Anambra steeti ji ewu n'elu soshal midia.,"Ọ bụ n'afọ 2019 ka omeiwu Charles Ezeani tụpụtara ya bụ iwu, tupu ụlọ omeiwu nke Anambra steeti suo ya kpọm na 2019 kwuru na ọ bụ iji mee ka oke ọnụ akwamozu na-ada na steeti ahụ datuo kpam kpam. Ezeani kwuru na ọ chọpụtara na akwamozu kwesiri ịbụ oge iru uju bịakwaziri bụrụ ọnọdụ oriri na nkwarị. O kwuru na iwu a ga-eme ka ndị mmadụ ṅụọ mmiri tọgbọ iko maka nsogbu ndị obodo na-enye ha ma ha na-akwa ozu. Lee ihe o kwuru n'uju ebe a. New Anambra Burial Laws: Ihe 10 dara ụda n'iwu akwamozu ndị steeti a Lee ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ n'ime iwu akwamozu ọhụrụ nke Anambra Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu a n'elu soshal midia. @TauhidAfc kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ katọọ ụfọdụ ihe megidere omenala n'ime iwu a. Lee akwụkwọ iwu ahụ n'uju ebe a Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-46057222,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46057222,Third Mainland Bridge: Nwoke a mabara na mmiri dị afọ '75',"Otu nwoke na-arụ ọrụ n'ụlọntaakụkọ Radio Nigeria aha ya bụ Oladejo O.R, makpuru n'oke mmiri igbu onwe ya n'ụtụtụ Fraịde bụ ụbọchi nke abụọ n'ọnwa Novemba, 2018.","Nwoke wụbanyere n'akwa mmiri 3rd Mainland Maazi Yemisi Nubi, bụ onye kwọ Oladejo n'ụgbọala mgbe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC nọ mgbe ihe a mere na ha nọ na-akpa nkata mgbe ọ gwara ha ka ha kwụsị ka ọ nyụọ mamịrị. Ka ụgbọala ahụ kwụsịrị, Oladejo buru onwe ya tuba n'ime osimiri. Tupu ọ nwụọ, Oladejo na-arụ ọrụ dịka ọkwọ ụgbọala na FRCN. Lee akpụpọụkwụ nwoke ahụ mabanyere na mmiri a Onye ọ na-akwọ n'ụgbọala bụ Oriakụ Ajanaku Aina, bụ osote onyeisi n'otu ngalaba na FRCN nke Legọs gwara BBC na Oladejo alaala ezumike nka, mana e nyere ya ọrụ n'ụdị Bekee kpọrọ ""contract"" ka ọ na-eche ka ego ngwụcha ya rue ya aka. Ndị gbata gbata gbara mbọ chọta nwoke ahụ Oriakụ Aina kwukwara na ọ bụ ya gwara Oladejo ka ha banye ụgbọala enyi ọrụ ya bụ Maazi Nubi. Ọ sị, ""ụgbọala o ji akwọ m nọ na be m ugbua."" Oriakụ Aina sị na Oladejo nwereike ịdị afọ 75. Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ihe a mere Ndị ọrụ gbata gbata mechara gụpụta Oladejo n'mmiri ma kwuo na ọ laala mmụọ. Nke bụ ọzọ n'ime ọtutụ mgbe ndị mmadu na-amaba n'ime mmiri na Third Mainland Bridge. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44920964,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44920964,"Obi rue gị ala, gọọmentị Anambara zuru ka eme - Okonkwo",Okonkwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na ugbua abụghị mbụ a na-ekwu okwu ide mmiri n'Anambara steeti.,"N'ọnụ ya ""eso m na kọmitii na-ahụ maka ịgbochi idemmiri, ama m ebe e dobere ngwa a ga-enye ndị mmadụ ma idemmiri kwobe"". O kwukwara na ndị mmadụ ekwesighị ịtụ egwu n'ihi na gọọmentị anambara steeti dị njikere oge niile. Cheta na ndị ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' (NEMA) na Bekee, kwuru na oke idemmiri ga-enye ndị mmadụ nsogbu n'Anambara steeti n'afọ a. Ndị Nema kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo ndị dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa. Onye na-arụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu Nigerian Hydrological Services Agency nke ngalaba Federal Ministry of Water Resources bụ Olayinka Ogunwale, kwuputara maka idemmiri a n'Ọka, ebe ha na-eme nzukọ ha na-eme kwa afọ, ebe a na-akọwa olileanya gbasara idemmiri a kpọrọ 'Annual Flood Outlook (AFO)' nke 2018. Clement Nze bụ onye nọchitere anya Ogunwale na nzukọ ahụ, kpọkuru gọọmentị Anambara nakwa NEMA, ka ha gbalịa hụ na ha mere ihe ga-ebelata oke idemmiri. Ogunwale kwuru na oke idemmiri abụghị ihe a ga-akwụsịnwu na Naịjirịa, mana ịkwado n'oge ga-enye aka ibelata mkpamkpa o nwere ike ịkpa. O kwukwara na osimiri na-asọbiga oke, oke mmiri ozuzo, na ihe ndị ọzọ dịka ndị mmadụ ịwunye atịtị n'ime ọwara-mmiri, na-etinye aka ibute oke idemmiri. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46100143,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46100143,Obi adịghị ndị mmadụ mma maka nzukọ IBB na Oby Ezekwesili,"Oby Ezekwesili na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, kpalitere okwu n'ọnụ ndị mmadụ ka o tinyere foto gosiri ka ọ nọ n'ụlọ IBB.","IBB ezigbo aha ya bụ Ibrahim Badamosi Babangida chịburu Naịjirịa dịka onye agha, mana o so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. Ka Ezekwesili tinyere foto ahụ, o kwuru sị ""mụ na Ibrahim Babangida bụbụ onyeisiala kpara nkata na Minna ka m kwuchara okwu gbasara ịzụpụta mmadụ nke Bekee kpọrọ 'Human Capital Development' n'ụlọakwụkwọ El Amin ụnyaahụ. Ekwuru m ya hoo haa na e kwesịrị ịnapụta Naịjirịa n'aka ndị 'ochie dike'. Nke a bụ ọrụ anyị bịara ịrụ."" Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ eziokwu ihe bugara ya n'ụlọ IBB. Ihe ha na-ekwu Ndị chọrọ ka ọ kọwaa ihe bugara ya @FabrohOkisoh kwuru sị na IBB abụghị onye Ezekwesili kwesịrị izute ma ọ burụ na ọ chọrọ ịnapụta Naịjirịa n'aka ndị 'ochie dike'. @MOHD_Ks kwuru sị na ọ gaara eji ohere o ji hụ IBB gaa hụ ụmụnwoke na nwaanyị na-azụ ahịa na Naịja steeti ma gwa ha maka ebumnobi ya ịzọ ọchịchị. @SobolaAbiola1 kwuru na ọ gaghị akwadozi ya maka njem a o mere. Ndị na-ahụghị ihe ọjọọ ọbụla n'ime njem o mere @OmamuliFaka na ajụ ihe mere ndị mmadụ ji akatọ njem ahụ, na ọ kaara ikwu na ọ gaghị aga nkuzi ọ gara ime n'ụlọakwụkwọ ahụ? @dymegyjoe kwuru sị na ọ dị mma na e nwere mmadụ na-eche ụdịrị echiche ọma a. Akụkọ ndị ga-amasị gị" media-54949330,https://www.bbc.com/igbo/media-54949330,Biafra: Akuko a siri imi n’ala ichoputa ebe aha a si pụta,"Biafra, aha malitere ịda ụda nnukwu n'ikpeazụ a.","Ya bụ aha diwara gboo dịka njirimara okeala niile dị n'ikpere mmiri oke osimiri Atlantic ebe ọ gafere mba ndị a: Naịjirịa, Kameroon, Ikwetoria Gini na Gabọn. Ị gaa na mapụ Afrịka, i ga-ahụ na okeala ndị a gbagọrọ agbagọ, bata n'ime ala karịa ebe ndị ọzọ dị n'ugwu Afrịka. Ọ bụ ya mere e jiri akpọ ebe ahụ niile ""Bight of Baifra"" bụ nke dị n'ime Gulf of Guinea. Ndị ọkammụta sị na ya bụ ""Bight of Biafra"" malitere na ""river Delta dị na Naịja, n'ugwu gbadaruo na Cape Loez dị na Gabọn. Ha kwukwara na mapụ nke 1710 gosiri na ọ nwere ebe ana akpọ Biafra dị n'ime Kamaruun mgbe ahụ. Nke a gosiri na ya bụ okwu bụ Biafra abụghị okwu Igbo, kama ọ bụ aha obosara ala dị n'akụkụ osimiri Atlantic nke gụnyere mba ndị a niile anyị gụpụtara na mbụ. Ya bụ aha digidere ruo 1975 mgbe gọomentị Naịjirịa gụgharịrị ya bụ aha kpọwazịa ebe ahụ niile ""Bight of Bonny"". Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ka ha were ya wepụ aha Biafra na mapụ. Mana nke ahụ akụkọ ụbọchị ọzo. Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra' Keduzia ka Igbo siri zawazia Biafra? N'ọnụ okwu ya, Mbazuruike Amechi bụ onye bụbu Minista njem ụgbọelu n'ọchịchị onyekwuo uche ya nke mbụ na Naịjirịa na 1962 ma bụkwara onye nwere ọnụokwu mgbe a nụrụ agha Bịafra kwuru na ya bụ aha bụ Ojukwu na ndị otu ya wetere ya. Mbazuruike sị na tupu ya bụ agha Biafra dapụta na Ojukwu bụ onye nọ n'isi ya bụ agha kpọchịrị ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nwere agba n'Ọwụwa anyanwụ na nga mgbe ya na ndị otu ya zara aha ahụ. O kwuru na ""o bụ na okeala dị n'ikpere mmiri nke Atlantic ka ya bụ aha si pụta"". Ihe ụmụ Igbo ama ama kwuru maka ịnweta Biafra Ụfọdu ekweghị na ha bụ Biafra Onye ọkammụta nke politikal Sayensi na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọnweghị ihe dị njọ mmadụ ị sị na ya achọghị ịbụ Biafra maka na ọbụghị mmadụ niile kwenyere na ya. Ọ sị na ihe butere nke a bụ agwa ndị mmadụ kpasara ibe ha mgbe agha. Ọ sị na nke bụ eziokwu bụ na ""Igbo dị n'ime Biafra otu ọtụtụ mba ndị ọzị sịkwa nọrọ n'ime okeala ahụ akpọrọ Biafra"". Onye ọzọ anyị jụkwara bụ ndị bu mwereonwe ndị Igbo n'isi na-achọghịkwa ka anyị kpọọ aha ya sị na onye senyere agbụrụ ndị ọzọ na-abụghị Igbo na mapụ Biafra emeghị ajọ ihe maka na ndị agburu ahụ nọ n'okeala akpọrọ Biafra ""mana ọ dị mkpa ịjụ ndị ahụ ka ha ekwetere iso na Biafra dịka ụbọchị siri dowe ihe na anya"". O kwuru na ya bụ ""nsogbu malitere tupu alụọ agha Biafra bụ mgbe gọọmentị Naịjirịa kebiri regọnụ ọwụwa anyanwụ ụzọ atọ iji mee ka ike ha daa"". Ọ sị na ya bụ nkewa butere ịkpaoke n'etiti agburu ndi nọ na ya bụ ogige akpọrọ Biafra. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Ọkụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-amụnye ga-eregbu anyị niile' - Mbazulike" afirika-45812367,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812367,Ike Ekweremadu ekwụọla na mkpọpụ ya ụlọikpe gọmentị na-eme bụ amụosu,Nke mere ọhụru bụ na gọmentị etiti anatala ikike inye osote onyeisi ndị Omeiwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu akwukwọ iku ikpe na ụlọ ọrụ ya nke dị n'Ụlọ Omeiwu ukwu n'Abuja.,"Ụlọikpe ọkaikpe Ndị ọkaiwu Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu ụnyaahụ bụ Wenesde ka enye onye nhazi nọ na Ụlọ Omeiwe Naịjirịa dị n'Abuja bụ Ekweremadu akwụkwọ iku ikpe. Nke a pụtara ka Celsu Ukpong, bụ onye okaiwu gọọmentị, kwara akwa arịrị na ha ahụghị ihu maọbu azụ Ekweremadu iji nye ya akwụkwọ bụ isi okwu. Cheta na gọọmenti kpụpụrụ Ekweremadu ụlọikpe makana ha si na okwuchaghị ka akụnaụba ya ha tupu ọ ṅụọ iyi oji bụru onye omeiwu. BBC gbara Uche Anichukwu bụ onye ndụmọdụ Ekweremadu na ihe gbasara ntaakụko ajụjụ maka ihe a na-eme. Mazi Anichukwu sị na agbanyeghi na onweghị ọtụtụ okwu ya nwereike ikwu maka okwu a makana ọ nọ n'ụlọikpe, uche ha bụ na ọ bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka eji na-avọpụta ya bụ okwu. Mana, ọkaiwu Ugo Egbujo gwara BBC na ya ahụghị mmekpa ahụ dị na okwu a. Ọ sị na ya bụrụ na gọmenti hụrụ ihe yiri ya mpụ ebe ọbula, ha nwere ikike ịgba onye ha che na aka ya dị n'ime ya akwụkwọ n'ụlọikpe. ""Ihe enwereike iji agba mmadụ akwụkwọ n'ụlọikpe karịri. Mana onye aka ya di ọcha enweghị obi mmapụ, tumadị maọbụrụ na-omegideghị ikike diri onye."" Ndị Omeiwu laghachitere ụlọ ọrụ ha ụbọchị Tuesde bụ ụbọchị nke iri nke ọnwa Ọktoba. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-44235637,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44235637,Jersey ndị Super Eagles ị nwere ọ bụ nke ezigbo?,Ebee ka ndị mmadụ si na-azụta uwe bọọlụ ọhụrụ Naịjirịa n'agbanyeghị na ndị mepụtara ya bụ Nike ebidobeghị ire ya n'ahịa?,"Nke a bụ mbụ nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi ga-aga asọmpi iko mbaụwa Ka a na-akwado ibido asọmpi iko mbaụwa nke 2018, ndị Nike kwuru na agaghị ebido ire ya ruo ọnwa Juun, mana nke a akwụsịghị ụfọdụ ndị mmadụ ịrụ nke bụ adịgboroja. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na a ga-ebido ire ya bụ uwe maka na asọmpi a ga-ebido n'ụbọchị ole na ole. Mana ọ dị ka ndị ọ 'kacha mkpa' agaala n'ihu ịzụta ya bụ uwe, ma zụta ya n'ọnụ ala, na-echeghị ka ndị Nike kwuru na ha ga-ere nke ha dọla iri na asatọ na ise ($85), bido ire ya. Nyocha BBC Igbo mere, gosiri na ụfọdụ na-ere nke adịgboroja, na-ere ya ihe dịka puku naịra isii (N6000), ebe nke ezigbo ndị Nike na-ere ruru pụkụ naịra iri atọ na otu (N31,000). Otu onye na-aza @hormoharkin na Twitter, kwuru na ọ ga-amasị ya inwe nke ezigbo, mana ọ zụtala nke adịgboroja. Otu onye na-ere ya bụ adịgboroja gwara BBC na nke ya bụ '100% polyester'. O kwukwara na nke ya bụ ""nke yiri ezigbo, mana ọ bụ nke ọma ya"". Ndị nwere Jersey ọhụrụ. Cheta na ndị Nike wepụtara nke ọhụrụ n'ọnwa Febụwarị. Ndị otu na-ahụ maka nchịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Naịjirịa Football Federation' (NFF), kwuru nso nso a na ndị na-achọ ịzụta uwe bọọlụ nke ezigbo bụ nke ndị Nike na-ere, eruola nde atọ (3 million). N'izu gara aga, Colin Udoh wụbu onye na-agbasa ozi gbasara ndị Super Eagles kwuru na ndị Nike ga-ebido ire ya bụ uwe n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee a. Lee ihe nkiri ụbọchị ndị Nike gosipụtara uwe ọhụrụ otu Naịjirịa. Ihe onyonyo na-egọsị uwe ọhụrụ ndị Sụpa Igụls Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46820865,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46820865,APC Campaign Council: Ihe mere ndị gọvanọ ha ji gbahapụ mbido nzukọ achụmnta vootu ha,Ụfọdụ ndị mmadụ nọ na mgbagwojuanya etu ndị gọvanọ ahọpụtara n'otu pati APC ji gbahapụ mbido nzukọ achụmnta vootu nke ha hibere maka ọkwa onyeisiala.,"Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari, bụkwa onye ji ọkọlọtọ pati ahụ azọghachị ọkwa onyeisiala n'afọ a, kọwara na nhibe a emere bụ iji tụlee ma binye aka n'usoro ehibere iji mee achụmnta vootu ahụ. Ndị gọvanọ a họpụtara n'otu pati a, bụ ndị enyere isi nlekọta nke otu achụmnta vootu a na steeti ha dị iche iche. N'okwu ọ gwara BBC Igbo site n'ekwentị ya, ọnụ na-ekwuru otu pati PDP bụ Kola Ologbondiyan, kọwara na nke a na-egosi nkwekọrịta ụmụ Naijiria nwere iji akwụkwọ vootu ha chụtuo ọchịchị Buhari. O kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala n'ihi enweghị ezi ọsịsa banyere ọtụtụ nsogbu ji obodo Naijiria aka ọjọọ. N'aka nke ọzọ, osote ọnụ na-ekwuru otu pati APC bụ Yekini Nabena, kwuru na ọ bụghị eziokwu na ndị gọvanọ otu pati ahụ gbahapụrụ nzukọ achụmnta vootu ha. O kwuru na a na-ele anya na ndị gọvanọ otu pati ha ga-agbado anya n'ọrụ ha dịka ndị isi nlekọta otu achụmnta vootu nke pati a na steeti ha dị iche iche. Atụmatụ a bụ nke ha na-ele anya ga-eme ka otu pati a nweta mmeri na ntụliaka ọkwa onyeisiala a ga-eme n'ọnwa Febrụwarị 2019. Akụkọ ga-amasị gị:" 46093999,https://www.bbc.com/igbo/46093999,Asuu strike: Ihe na-eme ugbua na mahadum ala Igbo,"Onye ntaakụkọ BBC Igbo achọpụtala na ọtụtụ mahadum dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa esoghi n'abụbọ-ọrụ ndị Asuu kpọrọ taa bụ Novemba 5, 2018.","Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Asuu bụ 'Academic Staff Union of Universities' na Bekee, kwuru na ha ga-eme abụbọ-ọrụ a ruo 'mgbe ebighi ebi' nke bụ ihe Bekee kpọrọ 'indefinite strike'. Mana onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ruo oge e dere akụkọ a, mahadum dịka 'Alvan Ikoku College of Education' esonyebeghị n'abụbọ-ọrụ a. Ndị a gbara ajụjụ ọnụ na mahadum a kọwara na ụmụakwụkwọ emechiela mana ndị nọ n'egwu ụla ka nọ. Na mahadum Abia steeti (ABSU), onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ha ka na-aga akwụkwọ. Otu nwata nwaanyị na-achọghị ka aha ya pụta n'akụkọ, kwukwara na ha nwere akwụkwọ taa bụ November 5, 2018, ma kwuo na ha ka ga-agakwa echi bụ Novemba 6. Mana o kwuru na ha niile chị obi n'aka makana ha amabeghi ma mahadum ha a ga-esonye n'abụbọ-ọrụ n'ezie. Ihe na-akpọtụ na Twitter Akwa na-akpọtụ ugbua na Twitter nakwa Facebook maka ozi Asuu zipuru na ha ga-ebido abụbọ-ọrụ n'ike. Asuu bụ Academic Staff Union Universities na Bekee kwuru na ha ga-emegide abụbụ ọrụ a ruo mgbe amaghị ama. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ agaala social media na-ebe akwa na abụbụ ọrụ a agbawaala ha obi. @Chinuamichael dere na a chọrọ igbu ya, makana oge ọbụla ebidoro abụbụ ọrụ a ọ bụ ndị ụmụakwụkwọ na-ata ahụhụ dị n'ime ya. @OMAAOFLAGOS kwuru na onweghị ihe obi ụtọ dị na ndụ ya maka okwu a. O kwukwara na ihe na-ebute anya mmiri bụ na mgbe ụmụakwụkwọ gụchara akwụkwọ o nweghị ọrụ na-eche ha n'iro. @OmokaroB dere na onye bụbu minista na-ahụ maka ụlọakwụkwọ gara mahadụm n'ofesi sịkwa na nnukwu nsogbu ka dị n'ihu ụmụaka na-eto na Naịjirịa. @eldarjames kwuru na nke a abụghị akụkọ ọhụrụ makana oteela ASUU bidoro ịme abụbụ ọrụ dị icheiche. @rasrap21 jiri abụbụ ọrụ mee ihe ịkpa ụka ọchị. Mana @NnaemekaNnadi dere na ASUU kwesiri ịga abụbụ ọrụ a makana o teela ha na-arịọ gọọmentị ka ha leba anya na nsogbu ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị" afirika-47893485,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47893485,Anambra Funeral Ban: Gbuoro onye ị hụrụ n'anya ehi 10 ma ị chọọ - APAMS,Kelvin Chukwumaobi bụ onye nwe ụlọọrụ na-ahụ maka akwamozu pụrụiche gwara BBC na ahụmihe mmadụ niile dị iche.,"Chukwumaobi a ma dịka Apams kwuru na o nweghi ihe ọjọọ dị na mmadụ imefu ego iji kwanyere nne ya maọbụ nna ya ugwu ikpeazụ. Mazi Chukwumaobi kwukwara na tupu mmadụ emee ihe na ọ ga-ele akpa ya anya mara ma ọ na-agwa ya eziokwu. ""Ihe gbasara akwamozu erughi ihe a ga-eji manye iwu"" ka o kwuru. Chukwumaobi ji imanye iwu gbasara udịrị akpụkpọụkwụ a ga-eyi n'ụlọomeiwu were maa atụ. Cheta na ndị ụlọomeiwu Anambara steeti manyere iwu ga-amachi oke mmemme nakwa mmefu ego n'akwamozu ọbụla. Pete Ibida so na ndị binyere aka n'iwu a gwara BBC na ihe ejiri mee nke a bụ iji tụgharịa echiche ndị Igbo gbasara akwamozu. Ị ma na akwamozu otu onye nwere ike ị bụ 'nke mmadụ niile' ""Ndị be anyị na-ewezi akwamozu ka mmemme dịka ekeresimesi, ụfọdụ na-ere ala iji kwaa ozu"" ka o kwuru. O kwukwara na ụfọdụ ụmụaka na-ahapụ nne ha na nna ha n'ụbịam, ha nwụzịa he ewee bido ịgosi ọgaranya n'akwamozu ha. Akụkọ ga-amasị gị:" 46993211,https://www.bbc.com/igbo/46993211,Ohaneze: Ndigbo ga-atụnyere Atiku,"Otu ama dịka otu kachasị elu n'ọnụ na-ekwuru Igbo Na Naijiria bụ Ọhaneze Ndigbo adọnyere Atiku Abubakar, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP.","Ndigbo kwenyere na ""restructuring"" Nke a bụ mkpebi ha kwekọrịtara ka ha mechara nzụkọ Imeobi ha mere n'Enugwu ụbọchị Tọọzde. N'akwụkwọ ozi ha wepụtachara ka ha mechara ọgbakọ ahụ nke onyeisi otu ahụ bụ Nnia Nwodo binyere aka, otu ahụ gbadoro ụkwụ na ọtụtụ ihe gụnyere nkwa nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara(restructuring) nke Atiku kwere na nkwa. Ihe ọzọ ha rụtụrụ aka bụ nhọrọAtiku họrọ nwa afọ Igbo bụ Peter Obi dịka onye ya na ya ga-azọ kọ dịka osote ya. Ohaneze kpọrọ ụmụ Igbo oku ka ha pụta n'igwe were PVC dịka ngwa ha ga-eji nweta nhazigharị obodo ka ọ dị mma. Ha bekukwara mbaụwa ka ha nye aka hụ na e nwere ntuliaka kwụ ọtọ. Ndigbo tụnyere m, arụtọpụ Akwammiri Naija nke abụo- Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla Ndigbo ka ha tụnyere ya na ntuliaka na-abịa iji nye ya ohere ịrụtọpụ ọrụ Akwammiri Naija nke abụọ nakwa ọrụ ndị ọzọ. Buhari kwuru nke a ụbọchị Tọọzde oge ọ gara Ọnịcha Anambara steeti maka ọsọ achumta vootu ya. O jiri ohere ahụ were gbape ụlọ ọkpụtọrọọkpụ Zik nke a kpọọ 'Zik Mausoleum' na bekee nke o kwuru sị na ""ọ bụ ọrụ kwesiri ka ọ bụrụ na a rụchara ya afọ iri abụọ gara aga."" Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi nọrọ ebe ahụ kwe Ndigbo nkwa na ewezụga ịrụ Akwammiri Naija nke abụọ na okporoụzọ ndị gọọmentị ji n'aka, na ha ga-arụ okporoụgbọ oloko ga-agafe Onitsha, Nnewi, Portharcourt na obodo ndị ọzọ dị n'ala Igbo. Buhari mechara gaa Enugwu maka achumta vootu ya. APC Imo achụpụ Hope Uzọdịnma? Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 Otu nkewa n'ime APC Imo kwuru na ha achụpụla Sen Hope Uzodinma bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha APC maka ebubo ikpa agwa megidere pati ha. Onyeisioche ha bụ Dan Nwafor gwara BBC Igbo na ha nwere mkpebi a ka ha mechara nnyocha mkpesa si Omuma Ward n'Oru-East mana onyeisioche nkewa nke ọzọ bụ Marcon Nlemigbo kwuru na akụkọ a bụghị eziokwu. Nlemigbo sị,""O nweghị ihe dị otu a. Ọ bụghị eziokwu. Egwu ka ha na-egwu."" Inec ajụla nritu Oby Ezekwesili nke ACPN rituru na ịzọ ọkwa onyeisiala. Inec kwuru na dịka iwu ntuliaka siri dị, onye chọrọ iritu ga-enye ụlọọrụ ha ozi abali iri anọ na ise tupu ntuliaka. N'ụtụtụ ụbọchị Tọọzde, Oby Ezekwesili bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati ACPN chịsara ọwa n'ịgba ọsọ ahụ sị na ya ga-adọnyere otu chọrọ ịnapu otu PDP na APC ngwa ọgụ ya. O kwuru na ọ kwekọrịtara nke a n'onwe ya dịka emechara ndọrịtaụka n'etiti ya na ndị ọzọ. N'egwuregwu, Mikel Obi abanyela otu egwu bọọlu Middlesbrough Mikel na- agbabuuru Tianjin Teda nke China bọọlụ Mikel onye gbabuuru Chelsea, enweghị otu ọ na-agbara kemgbe ọ hapụrụ otu egwu Tianjin Teda n'ọnwa gara aga. Mikel ga bụ onye Naijiria nke ise ga-agbara otu Middlebrough Yakubu Ayegbeni,bart Ogbeche,Karl Ikeme na Kenneth Omeruo." afirika-54812197,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54812197,End SARS: Ụlọikpe enyela CBN ikike ikpachi akara ọbaego ndi so kwado ngagharịiwe,Ụlọikpe dị n'Abuja enyela nkwado ka ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) kpachie akara ọbaego ndị so kwadoo ngagharịiwe 'End ARS'.,"Ọkaiwu Ahmed Mohammed nyere iwu a n'Abuja n'ụbọchị Fraịde dịka CBN gbara ndị ahụ akwụkwọ. Ụfọdụ ndị ya bụ ihe metụtara gụnyere: Adegoke Pamilerin Yusif, Umoh Grace Ekanem, Babatunde Victor Segun, Mulu Louis Teghenan, Mary Oshifowora, Winifred Akpevweoghene Jacob, Victor Solomon, Idunu A. Williams na Mosopefoluwa Odeseye. Ndị ọzọ bụ: Bolatito Racheal Oduala, Chima David Ibebunjoh, Mary Doose Kpengwa, Saadat Temitope Bibi, Bassey Victor Israel, Wisdom Busaosowo Obi, Nicholas Ikhalea Osazele, Ebere Idibie, Akintomide Lanre Yusuf, Uhuo Ezenwanyi Promise nakwa ụlọọrụ Gatefield Nigeria Limited. Ụlọikpe ahụ kwuru na a ga-akpachi akara ọbaego ndị ahụ ruo ụbọchị otu narị na iri asatọ (180 days) ruo mgbe ndị CBN ga-emecha nnyocha ha na-eme. Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naijirịa bụ 'Nigeria Immigration Service' kọwara na ihe ha jichie akwụkwọ njem nwaada Modupe Odele n'ọdọ ụgbọelu Legọs bụ maka na a na-eme ya nyocha. Ha kwuru na aha nwa ada a pụtara dịka onye na-ekwesịghị ime njem ọbụla maka nnyocha kama ha ekwughị onye na-eme nwaada a ya bụ nnyocha. Cheta na Odele bụ onye ọkaiwu so nye ndị mere ngagharịiwe 'End SARS' nkwado. Kama Odele gwara BBC na mgbe ha naara ya akwụkwọ njem ya, ha gwara ya na ọ bụ ndịagha na-enyocha ya. Odele mechara kwuo n'akara Twitter ya na ndị ọrụ NIS agwala ya ka ọ bịa were akwụkwọ njem ya kama ọ gwara ha na ọ bụ n'ụbọchi Mọnde ka ọ ga-abịa were ya. Modupe Odele ji ọrụ ọkaiwu ya gbaa mbọ ịgbapụta ndị na-eme ngagharịiwe ndị uweojii nwuchiri Cheta na akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ndị so hazie ngagharịiwe 'End SARS' nke mere n'ọdịnso a na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa amalitela imekpa ha ahụ. Otu onye n'ime ha bụ Modupe Odele kwuru na gọọmentị machiri ya ime njem gaa mba ofesi. Ebe mmadụ abụọ ọzọ aha ha bụ Akintomide Yusuf na Bassey Israel kwuru na gọọmentị akpachiela ọba ego ha nke na ha enwekwaghị ike ịdọrọ ego n'ime ya. 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ' Modupe Odele, onye e ji @Mochievous mara na Twitter kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba, oge ọ chọrọ ime nje gaa mba Maldives ka ndị ọrụ 'Immigrations' nwụchiri ya ma kwuo na ọ gaghị eme ya bụ njem. Odele bụ onye ọkaiwu nke gbara mbọ ịnọchite anya ndị mmadụ ndị uweojii nwụchiri oge a na-eme ngagharịiwe 'End SARS.' Ọ kọwara na oge ha tinyere aha ya n'igwe kọmputa ha, onyonyo ya pụtara nke na-egosi na ọ bụ onye a na-enyocha enyocha. Ndị ọrụ ahụ jigidere ya nwa oge ma mechaa tọhapụ ya, mana ha ekweghị enye ya akwụkwọ njirimara ya (passport). Ha gwara ya ka ọ kpọrọ ndị ọkaiwu ya lọghachi n'ụlọọrụ ha n'echi ya. Mana ka ihe niile a na-eme, o nweghi onye gwara ya ihe o mere e ji nwuchie ya. Ka echi ya ruru, ya bụ n'ụbọchị Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Nọvemba, Modupe laghachiri n'ụlọọrụ ndị 'immigration' mana ha ekweghị enye ya akwụkwọ njirimara ya. O kwuru na ha gwara ya na ọ ka bụ onye a na-enyocha enyocha, mana ha ekweghị agwa ya ihe o mere e ji enyocha ya. BB kpọrọ akara ekwentị ndị ọrụ nchekwa mbata na ọpụpụ na Naịjirịa, onye zara oku ahụ kwuru na ""ọ bụghị eziokwu na akwụsịrị onye ọbụla ime njem n'ihi na o sonyere na ngagharịiwe 'End SARS'. Onye ahụ na-ekweghị ekwu aha ya gara n'ihu kwuo na ""o nwerịrị ihe ọzọ kpatara e ji kwụsị onye ahụ ime njem, ọ bụghị maka ihe gbasara 'End SARS'. ""Ihe onye ahụ ga-eme bụ na ọ ga-ede akwụkwọ mkpesa degara isi ụlọọrụ anyị dị n'Abuja ka e lebaa okwu ya anya."" Ịkpachị ọbaego ndị mmadụ Onye ọzọ aha ya bụ Akintomide Lanre Yusuf kọkwara etu e si kpachie ọbaego ya dị n'ụlọakụ 'First Bank' n'agwaghị ya ihe ọbụla kpatara nke a. O kwuru na ọ bụ n'abalị iri na asaa (17) nke ọnwa Ọkutoba ka ọ chọpụtara na a kpachiela ọba ego ya. Oge ọ jụrụ ihe kpatara ya, ndị 'First Bank' gwara ya na ọ bụ na ụlọakụ etiti (Central bank) ka e si nye iwu ahụ. Kamgbe ahụ, o deela akwụkwọ degara ndị 'Central Bank mana onwebeghi ihe ọbụla nwere isi. Onye ọzọkwa aha ya bụ Israel Bassey kọọrọ ndị ntaakụkọ 'Punch' na a kpachikwara ọbaego ya dị n'ụlọakụ 'Access Bank' Bassey kọwara na ya bụ onye dibia bekee ma bụrụkwa onye so na-elekọta ndị merụrụ ahụ na ngagharịiwe 'End Sars' na Pọtakọt. O kwuru na ọ bụ n'abalị iri na ise nke ọnwa Ọktoba ka ọ chọpụtara na a kpachiela akpa ego ya n'ụlọakụ. Oge ọ jụrụ ese, ha gwakwara ya na ọ bụ ndị CBN nyere iwu ahụ. Bassey kwuru na mbọ niile ọ gbara ka a kpọpeere ya akpa ego ya enwebeghị isi. Mimi Ade-Odiachi kọwakwara etu ụlọakụ GTB si kpachie akara ọbaego ya Na nke dị ka ibe ya, otu ụlọọrụ a kpọrọ 'Gatefield Nigeria Ltd' gbara ụlọakụ 'Access Bank' akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịkpachi akara ọbaego ha. Dịka ụlọntakụkọ 'Bloomberg' siri kwuo, ụlọọrụ Gatefield so na ndị gbara onya ego iji nweta ego ha jiri kwado ndị ntaakụkọ kwụrụ onwe ha n'ọrụ ịchụ nta akụkọ metụtara 'End SARS'. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị CBN, o kwuru na ya amaghị maka iwu ọbụla e nyere iji kpachie akpa ego ndị mmadụ n'ụlọakụ. Kemgbe okwu a na-ewu na soshal midia, o nwebeghị onye ọbụla nọ na gọọmentị kwuru ihe ọbụla gbasara ya. Cheta na ngalaba gọọmentị etiti na-elekọta ndị mgbasaozi, a kpọrọ 'National Broadcasting Corporation', tara ụlọntaakụkọ dị icheiche ahụhụ maka ịgbasa ozi gbasara 'End SARS'. Mana ọtụtụ na-ekwu na ha agaghị eji maka mmekpa ahụ gọọmentị na-emekpa ndị mmadụ kwụsị ikwu okwu maka ọdịmma Naịjirịa." egwuregwu-50368536,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50368536,Manchester United vs Brighton: Man Utd emewela ụwa 'shut up',Ndị otu egwu bọọlụ Manchester United mere ka ọbụghị ha taa mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ndị Brighton,"Goolu mbụ Man Utd nyere bụ ọnatarachi Nke a mere ka ha gbagote n'ogo ndị nke asaa na tebulu 'English Premier League'. Oteela Man Utd gbawara ọnyụpa n'asọmpi a mana ha biliri n'ụra taa. Ndị nyeteere ha goolu gụnyere Pereira na Marcus Rashford. Propper, onye Brighton, ji aka ya nye onwe ha goolu nke mezuru ya atọ, ebe Dunk satara otu goolu. Etu okwe si gbaa Rashford bụ nnọọ okwu a kpụ n'ọnụ taa n'ihi etu o si chakee ka kpakpando. Ọ gaara enyekarị otu goolu mana oche bọọlụ ndị Brighton gbalịrị nke ukwuu. Mana ofu ihe ka na-ara ndị Man Utd ahụ bụ igbochi ndị mmadụ inyeta ha goolu. Kamgbe afọ bọọlụ 2019/2020 malitere n'ọnwa Ọgọst, naanị ugboro abụọ ka Man Utd gbochirila ndị mmadụ inyete ha goolu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria" afirika-54768024,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54768024,'Etu e si gbagbuo ụtọ obi m n'ihu m n'Oyigbo'- Monday Bakor,"Akwa arịrị ka Monday Bakor ji gwa BBC Igbo etu mgbọ si n'egbe ndị ọrụ nchekwa gbara n'ụlọahịa ya, si tugbuo Queen Nwazuo bụ nwaanyị ọ na-akwado ịlụ n'ihu ya n'Oyigbo, Rivas Steeti.","Bakor kwuru na ihe a mere n'ụbọchị Ocktoba 22, 2020 mgbe ha nọkatara nụwa ụda egbe aghara aghara n'okporoụzọ Oyigbo. O kwuru na ọ bụ ebe ha na-akwado imechi ụlọahịa ha ka ha nụchara ụda egbe ka onye uweojii kpu okpu na-acha uhie uhie gbapụrụ egbe n'ebe ha nọọ ma gbuo Queen. Bakor kwuru na ọ na-efe ala nna ya n'Oyigbo. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni kwuru ka Monday Obakor bia mee mkpesa gbasara ọdachị a n'ụlọọrụ ha ma ewepụ mmachị ngagharị dị n'Oyigbo ugbua. Cheta na ndị omekome weghara ngaghariwe udo ndị End SARS mere nso nso a wetere ọgbaghara n'Oyigbo mere ka gọọmenti Rivers State tinye mmachị ngaghari ebe ahụ. Akụkọ mechakwara pụta na ndị ọrụ nchekwa na-aga n'ụlọ egbu ndị ha chere na ọ bụ ha wetere ọgbaghara a, mana anyị ka na-enyocha akụkọ ahụ ịmata maọbụ eziokwu. Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a. Ihe nwanne nna Queen Nwazuo o jiri mere nne kamgbe nne na nna ya nwụchara bụ Evangeline Mgbeahụrụ kwuru na anapụla ha nwata bu oke amamihe. Evangeline kwuru na Queen bụ nwata na-enweghị nne na nna makana ha anwụọla mgbe ọ nọ elementri 2. O kwuru na Queen bụ nwata akwụkwọ Mahadum Abia Polytecnic, Aba branch. O kwuru na ọ bụ ezigbo nwa na-erube isi ma nwe oke amamihe. O kwuru na ka ọ dị ugbua, ha ebulatabeghị ozu Queen n'Abia steeti ebe o si makana obodo Oyigbo ka dị ọkụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47106804,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47106804,Ohaneze Ndigbo: Ipob pụtanụ tụọ vootu ka ụnụ chụpụ ndị ọchịchị ọjọ,Otu Ohaneze ndị Igbo ekwuola na otu ha ka akwụchịm n'onweghị ihe mebiri n'etiti ha.,"Osote odee akwụkwọ otu ahụ bụ Chuks Ibegbu gwara BBC Igbo na ha ka akwụsị ike na mkpebi ha na ha ga-eme ngagharị n'akụkụ Naịjirịa ebe ndị Igbo bi iji gwa ha mkpa ọ dị itụ vootu. Ibegbu kwuru na Ohaneze na-ewepụta ihe ha kpọrọ 'Ohaneze Observers' ka ha kirie ka ntuliaka 2019 si aga. Ha rịọrọ ka Indigenous People of Biafra bụ Ipob pụta soro tụọ vootu ka ha wee tụpụ ndị ọjọ nọ ọchịchị ugbua. Cheta na Ohaneze Ndịgbo ekwuola na ha ga-ebido ị gagharị n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ime ka ndị Igbo mata mkpa ọ dị ka ha soro mee ntuliaka na-abịanụ. Odee akwụkwọ otu Ohaneze Ndịgbo bụ Chuks Ibegbu kwuru na Ohaneze agaghị achọ ka ndị si mba ọzọ batawa n'obodo ugbua maka ịsonye na ntuliaka. Ọzọ, Ndị Ụlọmeiwu na-akwenyere onye otu ha nwụru ugwu Ụlọomeiwu ukwu enyela iwu ka akwụsị ikpe o wepụrụ n'ụlọikpe ukwu gbasara nkwụsị ọrụ ọkaikpe ukwu, Walter Onnoghen maka ọsọ enyeamaka ""National Judicial council"" gbatara na ya bụ okwu. Ọnụ na-ekwuchitere onyeisioche Sineti Bukola Saraki bụ Yusuph Olaniyonu kwuru na ụlọomeiwu kwuru ka enye NJC ohere ka ha me ihe dị n'ikpe onnoghen. N'Ofesi, Ihe ruru mmadụ asaatọ anwụọla n'ọkụ ọgbụgba na-agba n'ụlọ dị na Paris dịka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ọkụ ọgbụgba na mba ahụ si depụta. Mmadụ iri atọ merụkwara ahụ. Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịgbagote. A mabeghị ihe kpatara ọkụ ahụ. N'Egwuregwu, Obi adịghị onye nchịkọta otu egwuregwu Liverpool mma bụ Jurgen Klopp maka etu ha si hara iha n'asọmpị ha na WestHam gbara n'abali Februwarị atọ. Nke mere ka ha jiri pointi atọ wee rituo n'ogo ha nọbụ na tebulu Premier League. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Mr Raw: Ihe mere m jiri e ji Igbo eme 'rap'" afirika-48371612,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48371612,Building collapse: Ụlọ elu adagbuola Injinịa na-arụ ya n'Ọnịcha,Ụlọ elu ogogo atọ dị n'okporoụzọ Ezenwa adagbuola onye Injinịa na-arụ ya n'Ọnịcha nke Anambra Steeti.,"Building collapse: Ụlọ elu adagbuola Injinịa na-arụ ya n'Onicha Content is not available End of Facebook post, 1 Mana akụkọ na-ekwu na ọ dịka onye Injinịa a nwụrụ mgbe igwa katapilla na-egwupụta ya dọkara otu ụkwụ ya. Ụlọ elu a bụ nke a sị na a na-arụ ọhụrụ dara n'ehihie a mgbe onye Inginịa na-ahụ maka ụlọ ahụ bịara ịma ka ọrụ si aga n'ebe ahụ. N'erughi nkeji iri ọ bịara ebe ahụ dịka anya hụrụ ya si kwuo na ụlọ a dara ma dakwasị n'elu onye Inginịa ahụ na ndị ọzọ na-arụ ụlọ ebe ahụ. Anya hụrụ ka ihe ji eme kwuru na ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe ahụ. Dịka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mmadụ ise n'ime mmadụ asaa nọ n'ime ụlọ ahụ, mmadụ anọ ka dị ndụ ebe otu onye bụ Injinịa anwụọla mana ọ fọrọ mmadụ abụọ. Ndị a akpọpụtara ka dị ndụ dịka eburula ha gawa ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ndị uwojii n'Anambra Steeti ịnụta n'ọnụ ha banyere nke a mana ha azaghị oku ha. Onyeisi ndị otu Injinia na Onisha bụ Ikenna Aniekwena ekwuola na ọ bụ amaghị ọrụ na ejighị ngwa ọrụ zụrụ oke kwaturu ya bụ ụlọ. O kwukwara n'igwe e ji ruo ya bụ ụlọ ezughị n'ọnụ ọgụ. Na kama iji igwe milimita asatọ na ihe e jiri rụọ ya bụ ụlọelu atọ bụ milimita anọ. Ọ sịkwa na blọkụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ esighi ike ma tinyekwa na ndị otu ha ekporola aja ebe ahụ iji mee nnyocha puruiche. Ifeanyi sị na ka ọ dị ugbua, ma ndị gọmenti ewerela ya bụ ala ebe arụrụ ụlọ ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-52510765,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52510765,Workers' Day: Lee nsogbu ise coronavirus buteere ndịọrụ,"Abali mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbụla bụ ụbochị ndịọrụ ji agbakọ emerube ụbọchị, mee 'parade', ma tụọ alo etu ha si akwado akụnaụba na mwulite obodo, mana n'afo a, egwu adaghariri n'ihi oria coronavirus.","Dika onyeisioche otu NLC ngalaba nke Enugwu steeti bụ Comrade Virginus Nwobodo si gwaa BBC Igbo, onye ọbụla nọ be ya n'ihi ụjọ coronavurus."" Kemgbe ọrịa coronavirus malitere kpaba ike na Naijiria bido na ngwụcha onwa Februwari afọ 2020, oge onye mbụ bubatara ya,ọnọdụ ndị ọrụ na Naijiria dịzi ka nke nwaanyi ime na-eme; etu ọbụla o si tụgharịa,nsogbu. Workers' Day: Ndịọrụ ahụike na-ekele ụmụ Naịjirịa n'ụbọchị ncheta ndịọrụ Nsogbu ndi a metutara ahụike, ọnọdụ ọrụ,mmefu ego ntụmadi, na ọdịda akụnauba ezinaụlọ. Nwobodo, onye kwuru na ""ụjọ coronavirus bụ ahụoku nke onwe ya"" si na coronavirus mere ka ha na-emefu oke ego ịga ọrụ nakwa ịzụ nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa maka ezinaụlọ nke na "" ego ndịọrụ anaghị ezuziri ha n'ọnwa."" Ọ bụghi naanị ihe ndị a ọ rụtụrụ aka, lee ụfọdụ ajọ ọnọdụ Coronavirus tinyerela ọtụtụ ndịọrụ: May Day 2020: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19 1. Ezumike akwụụgwọ Mmachi ngaghari kpochiri ụzọ ọtụtụ ụlọọrụ dị na Naijira si achụta ego dịka ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ. N'ọnwa Eprel, ụlọọrụ ụgbọelu Arik kwuru na malite n' abali mbu nke onwa Mee afọ 2020, na ọtụtụ ndịọrụ ha,(pasent 90), ga-anọrọ ezumike akwụ ụgwọ rue mgbe a mabeghị n'ihi na ego anaghịzị abata dịka e nweghịkwa ndị na-eme njem ụgbọelu ugbua. 2. Mgbubi ụgwọọnwa Kedụ nke I ga-ahara n'ime zuo ike n'ụlọ na anaghị ụgwọọnwa na rụọ mana anyi ga-egbubi ụgwọọnwa gi? Goomenti Kaduna nyere iwu ka ewepu pasent iri abụọ na ise(25%) na ego ndi welitere isi n'ọrụ oyibo steeti ahụ iji kwado mbọ a na-agba ịhụ na agụụ egbughị ndị ogbenye n steeti ahụ dịka a machiri ngaghari maka coronavirus. Mana ya bụ atụmatụ atọghị ndị ọrụ steeti ahu ọchị ma ọlị. Otu onyeisioche otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC na steeti ahu bu Ayuba Suleiman kwuru na ọ bụghị na mmanye ka a ga-asi ndịọrụ tinye ego were kwado ọgụ megide coronavirus. "" O kwesịrị ịbụ o metụta gị n'obi ịtụnye nke gị."" Ọ bụghị naanị Kaduna steeti mere nke a, Arik gbubiri ụgwọọnwa ndịọrụ ha n'ọnwa Eprel tupu a gwa ha nọrọ n'ụlọ. 3. Ichụ n' ọrụ Ndị Igbo sị na ọ naghị ahịa ahụ, ọ hịawa ahụ. Ka ọchị, ka egwu, ụfọdụ ndịọrụ ga-esi na ịnọ n'ụlọ ghọọ ndị enweghị ọrụ. Otu jikoro ndịọrụ njem ụgbọelu bụ ' International Air Transport Association'(IATA) na Bekee gbara ama na ọrụ dị 91,380 ga-ala mgbuka na Naijiria dịka ọnụgụgụ ndị njem ụgboelu ji nde ato na uma ise(3.5m) gbatuo n'oge corona virus a. O bughi naani ugboelu, otutu ulooru akpuola afo n'ala nke na ha agaghi enwe ike kulie ozo ma coronavirus laa. Onye makwanu mgbe o ga-ebi? 4. Ọrụ ezu ike Ajị ekweghị ka a mara na ọsịsa na-agba nwa mkpi. Na ọtụtụ ndịọrụ nọ n'ụlọ ezu ike maọbụ si n'ụlọ na-arụ kemgbe mmachi ngagharị ekweghị ka a mara na o nwere ndi ekutebeghị ume kemgbe coronavirus batara Naijiria. N'ozi o ji kelee ndịọrụ, ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ a, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkita Osagie Ehanire sị, ""Ana m kelere ndịọrụ ahụike dịka ndị dọkịta,nọọsụ, ndịọrụ 'lab', na ndị niile na-arụ ọrụ kwa ụbọchị kemgbe coronavirus bidoro."" Mana ọ bụghị naanị ndịọrụ ahụike bụ ndị aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko n'oge a. Ndị uweojii, ndị ntaakụkọ, ọbụladị otu 'Presidential Task Force on Covid -19' na-arụ ọrụ kwa ụbọchị, na ezughị ike kemgbe coronavirus malitere. 5. Ọnwụ akwadoghị akwado Kemgbe coronavirus bidoro ndịọrụ ụfọdụ nọ n'ihu agha megide ọrịa ọjọọ a ebutela ọrịa n'ihu ọrụ, ebe ụfọdụ tụnyerela ndu ha. Dika ozi si na NCDC puta si kwuputa na ụbọchị iri atọ nke ọnwa Eprel, ndịọrụ ahụike gunyere ndị dọkịta, nọọsụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ dị 113 ebutela ọrịa coronavirus, ebe ihe ruru anọ nwụrụ anwụ. Ka o si kwuru taa bu 1/5/2020, na Naijiria,mmadu 1,728.ebutela coronavirus,ebe mmadu 51 nwụrụla site na ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-51825484,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51825484,HIV Cure: Agwọtala onye ọzọ bu ọrịa HIV,Otu nwoke na London aha ya bụ Adam Castillejo abụrụla onye nke abụọ a gwọtara ọrịa HIV n'ụwa niile.,"Adam Castillejo wants to be ""an ambassador of hope"" Ndị dọkịta chọpụtara na Castillejo enweghịzi nje HIV ka ọ gachara ọnwa 30 ọ kwụsịrị ịnara ọgwụgwọ maka ya. Ihe tụrụ n'anya bụ na ọbụghị ọgwụ HIV gwọrọ ya. Ihe gwọrọ ya bụ nke a kpọrọ 'stem-cell treatment' bụ nke ọ natara maka ọrịa cancer ọ rịaburu. Dịka akwụkwọ nnyocha the Lancet HIV si kwuo, e nwere ndị ahụ ha anaghị anabata nje HIV. Ọ bụ ndị dị otu a nyere Castillejo 'stem cells' ha nke mere ka ahụ ya kwụsịkwa ịnabata nje HIV. N'afọ 2011, Timothy Brown onye obodo Berlin na Jamanị bụ onye mbụ a chọpụtara na ọrịa HIV ya alaala. A hụghị nje ọrịa ahụ n'ahụ Brown ka ọ gachara afọ atọ na ọkara ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ. Timothy Brown natakwara ọgwụgwọ 'stem cell treatment'. Gịnị bụ stem cell treatment? 'Stem-cell transplants' bụ usoro ọgwụgwọ pụrụ iche e ji agwọ ụfọdụ ọrịa siri ike dịka sickle cell, diabetes na ndị ọzọ. Ọ bụrụ na onye nyere mmadụ 'stem cells' ya nwere ọrịa ahụ ya anaghị anabata nke Bekee kpọrọ 'immunity', onye ahụ ga-enwetakwa 'immunity' ahụ. Ndị dọkịta na-ekwu na ọ dịka onye nyere Castillejo 'stem cells' ya nwere 'immunity' maka ọrịa HIV. Ọkammụta Ravindra Kumar Gupta, nke Mahadum Cambridge, gwara BBC na nke a pụtara n'ọrịa HIV alaala n'ahụ Castillejo kpam kpam. Gupta kwuru sị: ""O ruola afọ abụọ na ọkara ọṅụbeghị ọgwụ mana HIV anọghịzị n'ahụ ya."" ""Nchọpụta anyị goziri na 'stem-cell transplantation' nke gwọrọ HIV afọ itoolu gara aga nwere ike ime ọzọ."" Nnyocha na-ekwu na ọ ga-ara ahụ tupu HIV alaghachikwa n'ahụ Castillejo ọzọ. Mana onwebeghị onye ma nke ga-eme n'ọdinihu. Castillejo n'onwe ya kwuru na nke a bụ nnọọ ihe ịtụnanya. O kwuru sị: ""A chọrọ m ịbụ onye na-egosipụta olileanya."" ""Achọghị m ka ndị mmadụ na-ele m anya dịka onye pụrụ iche."" Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-43862347,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43862347,"Liverpool, Roma, Real Madrid na Bayern Munich na-akwado asọmpi",Ọsọ ihu ọnọdụ ikpeazu n'asọmpi UEFA Champions League ebidola.,"Liverpool na Asọmpị enyi na enyi Liverpool na Roma n'afọ 2016 N'asọmpi ọkara-ịkpeazụ na-abịa, Bayern Munich na Real Madrid, Liverpool na Roma na-akwado ịsọ mpị egwuregwu nke mbụ ga-eme ka amara onye ga-emeri ma gafee n'asọmpi ikpeazụ. Liverpool na Roma ga-asọ mpi ha echi bụ ụbochị 24, Bayern Munich na Real Madrid ga-asọmpi n'ụbọchị 25 n'ime ọnwa a. Kenneth Umerie bụ onye ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ gwara BBC Igbo na asọmpị a ga-ekpo ọkwụ. Mana o kwuru na Liverpool nwere ike imeri Roma n'asọmpi a makana oteela otu ọbụla meriri Liverpool n'ụlọ ha. O kwuru na Mohamed Salah, Sadio Mané na Roberto Firmino ka na-eme nke ọma n'otu Liverpool. Jupp Heynckes na Zinedine Zidane N'asọmpị Bayern Munich na Real Madrid. Umerie kwuru na Bayern Munich na Real Madrid na-eme ihe siriike. Ihe pụtara na ọ ga-dị ọrụ ị ma ka asọmpị a ga-aga. Ugbua, Bayern Munich emeriela Bundusliga nke afọ a, nke a akpaliteela mmụọ ha, ma nye ha olileanya na ha ga-eru ikpeazu n'asọmpị Champions League. Asọmpi nke ikpeazu Champions League ga-eme n'ụbọchị 26 n'ime onwa Mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44085415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44085415,Otu Rochas Okorocha asaala Toe Ekechi maka ọkụ gbara ụlọọrụ APC,Sam Onwuemeodo bụ onye odeakwụkwọ gọvanọ Rochas Okorocha gbasara ndị ntaakụkọ gwara BBC Igbo na ebubo Theodore Ekechi boro Okorocha bụ asị.,"Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga O kwuru na ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ PDP bụ ndị gbara ụlọọrụ a ọkụ. N'ọnụ okwu ya ""Rochas bụ onye kwụrụ ụgwọ maka ị zụ ụlọọrụ a, kedu ihe ga-eme ka ọ bụrụ na ya bụ onye gbara ebe a ọkụ?"" Onwuemeodo kwuru na otu PDP nụrụ na APC chọrọ ị me ntụlịaka ịmeụlọ, ihe a mere ka ha bịa mebisie ihe niile. O bo kwa Ifeanyi Araraume bụ onye nwere olileanya ịgba ọsọ ntụlịaka 2019 dịka gọvanọ Imo steeti ebubo na ya bụ onye ana arụ aka mere ihe a. Onwuemeodo kwuru: ""gọvanọ niile chiburu Imo ka Araraume busoro ọgụ, ọ bụ iwu na ọ ga-abụ govanọ Imo steeti?"" Rochas Okorocha kwuru na onweghị ihe dị njọ na ọchịchị ya Oge BBC Igbo juru Onwuemeodo ebubo ha na-ebo Okorocha maka ị tinye ọgọ ya n'okwa ọchịchị, Onwuemeodo kwuru na onweghị ihe dị njọ na Okorocha chọrọ ka ọgọ ya ba n'ọkwa ọchịchị. O kwuru: ""na Amerika, oge George Bush chịburu na kwa o nyere nwa ya aka ọ ba kwa n'ọkwa ọchịchị? Gịnị mere nke Rochas ga-adị iche?"" Okwu a malitere oge Theodore Ekechi bụbu kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo steeti ekwuola na ọ bụ Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị otu ya mụnyere ụlọọrụ APC ọkụ ụnyaahụ. Ekechi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ndị Imo jụrụ Rochas Okorocha maka arụ ọ na-eme na steeti ahụ. O kwuru na nsogbu a niile bidoro mgbe ya na ndị otu ya jụrụ ka gọvanọ webata ọgọ ya nwoke n'ọchịchị Imo steeti. N'ọnụ ya, ""onweghịzi onye kwụnyeere nwoke a maka ihe ọjọ o merela na steeti anyị."" Ihe Ekechi kwuru maka ntuliaka ime ụlọ ha mere Cheta na Gọvanọ Okorocha kwuru na ọ bụ makana ezuru ngwongwo eji eme ntuliaka ụbọchị satọde gara aga mere o ji daa na ya bụ ntuliaka. Kamgbe ahụ ọ na-arịọ ka emegharịa ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-44166082,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44166082,Ndị Medview akwụwala ndị njem n'ọdọ ụgbọelu Abuja,Ndị chọrọ iso Ulọọru Medview site Abụja gawa Legọsị tọrọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdi Azikiwe n'Abuja kamgbe ụnyaahụ.,"Ndị ahụ gbatara akwụkwọ njem ruru ọdọ ụgbọelu we chọpụta na Medview enweghị ụgbọelu na-aga ebe ọbụla. Emechara gwa ha na a ga-etinye ha n'ụgbọelu Dana mana emeghi otu a n'ikpeazụ, agbanyeghị na ndi mmadu chere ruo elekere iri nke abalị. Ndị Medview mechara sị ka ndị mmadụ lagachịte taa maka ị bido njem ha. Ka ha ruru ọdọ ụgbọelu n'ụtụtụ a, ọkwa otu akụkọ a ka ha nụrụ, ka ndị ọrụ Medview kwukwara na ga ga-etinye ndị mmadu na ụgbọelu Arik, bụ nke ga-amalịte njem na elekere isii nke abalị tata. Ọtụtụ n'ime ndị a tọrọ n'Abụja gwara BBC na ihe ndị ọrụ Medview gwara ha bụ na-onweghi ụgbọelu obula ga-aga ebe ọbụla. Ndị n'ime ndị nkem a chọrọ ka enyechia ha ego ha kwụrụ gwara BBC na ndi Medview kwuru na ha adịghị enyechi ego. Ọtụtọ a ndị a tọrọ n'Abụja bụ ihe iwe nye ọtụtụ n'ime ha, ọkachasị ndị ihe na emebịnaghị maọbu ndị na-aga ọrụ. Otu nwoke BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ ọrụ ka ya na-aga na mba Ghana. Okwuru na ọ ya ruo Legọsị, ọ banye ụgbọelu ga-eburu ya gawa Ghana. Ihe onye njem gwara anyị: Ihe onye njem Medview gwara BBC Igbo Otu onye so na ndị njem a gwara BBC na ihe kachasị iwe ya iwe bụ a onweghi ihe ọbụla ndị Medview chọrọ ime maka ụfọdụ n'ime ha enweghi ebe ha ga-edobe isi n'Abuja. Iwu ji njem ụgbọelu kwuru na ekwesiri inye ndị tọrọ n'ọdọ ụgbọelu ebe ha ga-alalụ ma ya bụrụ na ụgbọelu efepụghị. BBC Igbo gbara mbo ị nweta isi ụlọrụ Medview ịnụta ọnụ ha maka ihe na-eme mana onweghi onye zara. Ihe iwu kwuru maka ụdịrị ihe a Iwu nyere ihe ndị ụlọọrụ ụgbọelu ọbula kwesiri ime ma ọ bụrụ na ha enweghi ike i mee njem" afirika-47750495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47750495,Sex for marks: Aka akparala onye nkuzi na-eme ka nwata akwụkwọ rachaa ya utu tupu o bufee ya,"Ndị uweojii kwuru na onye nkuzi a ma dịka Akintunde Ajayi, na-amagide nwatakịrị ahụ dị afọ 18, ka ọ rachaa ya utu tupu o bufee ya n'ule.","Ha kwuru na ihe a na-eme n'ụlọakwụkwọ Fazir-I-Omar dị n'Iwaya dị na mpaghara Yaba dị na Legọs steeti. Ka BBC kpọtụrụ ndị uweojii Legọs steeti, Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuchitere ha kwuru na ha anwụchiela onye nkuzi ahụ dị afọ 39 n'ezie, na-enyocha ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ otu nwata akwụkwọ obi kara kwulitere okwu na onye nkuzi ahụ na-abagide ụmụagbọghọ ụlọakwụkwọ a. Nwata akwụkwọ ahụ kwuru na onye nkuzi ahụ bụ onye a na-atụ ụjọ maka etu ọ na-esi amaja ụmụakwụkwọ. O kwukwara na ọ na-abụ ụlọakwụkwọ chọọ ịgbasa, o nye ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị iwu ka ha bịakute ya n'ụlọorụ ya; bụ ebe ọ ga-anọ chebiri ka ụlọakwụkwọ gbasaa ọfụma nakwa ka ndị mmadụ lasachaa. Nwata ahụ kwuru na ọ na-ebu ụzọ chọọ idina ha, mana ha jụ, ọ mee ka ha rachaa utu ya. O kwuru na onye nkuzi a malitere ime ya ihe a oge ọ ka nọ na SS1, megide ya gafee mgbe ọ nọ SS2. Onye nkuzi ahụ gọrọla ụkwụ ya na aka ya, kwuo na ọ naghị eme ihe e boro ya, kama na nwata akwụkwọ ahụ boro ya ebubo bụ onye a ma ama na-edina ụmụakwụkwọ ụmụnwoke ibe ya. Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụzị bụ ""kedụ etu o si mara na ọ na-edina ụmụakwụkwọ ndị ọzọ""? Ndị uweojii kwuru na ha ezigala ụfọdụ ndị ọrụ ha n'ụlọakwụkwọ ahụ ka ha gaa legharịa anya ma chọọ ma e nwere ụmụakwụkwọ ndị ọzọ onye nkuzi a na-abagide na-abụghị naanị onye nke kwulitere okwu. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51687689,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51687689,Enugu LGA Elections: Otu patị 91 na-azọ na ntuliaka n'okpuruọchịchị ime obodo n'Enugwu,Otu patị 91 na-azọ ọkwa isioche okpuruọchịchị obodo n'Enugwu.,"Onye nchịkọta vootu na ụlọakwụkwọ New Haven Primary dị na Enugwu Nọt Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu steeti bụ nke Bekee kpọrọ ""Enugu State Independent Electoral Commission"" (ESIEC) amalitela ihazi ntuliaka a ga-eji họpụta aka ga-achị okpuru ọchịchị ime obodo 17 nakwa ọchịchị obodo 261 na Satọde bụ abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Febụwarị 2020. ESIEC sị na ọ bụ mmadụ 296 na-azọ ọchịchị n'okpuru patị 36 ị bụ aka na-achị okpuru ọchịchị ime obodo nke Bekee kpọrọ ""Local Government Chairman"". Content is not available End of Facebook post, 1 Ha ekwughi mmadụ ole na-azo ọkwa ị bụ ihe Bekee kpọro ""Counsilor"" n'ime ọchịchi obodo 261 di n'Enugwu steeti. Lee ka ntụlịaka a sị aka Okpuru ọchịchị Udi Ụzọ ụlọọrụ okpuruọchịchị Udi Ka ọ dị ugbuaAnyị abatala Udi local govt area n'Enugwu steeti.N'Eke na ""End ward"" dị n' Udi. ndị mmadụ juputara ebe ahụ na atụ votu, enweghịkwa ọgba aghara ọbụla na ebe ahụ. Ndị na-ahazị ntụliaka n'udi N'isi obodo Enugwu steeti Dịka BBC Igbo hụrụ, n'Enugwu bụ isi obodo steeti ahụ ọtụtụ mmadụ nọ be ha mana ụfọdụ mmadụ na-aga n'ụzọ. Artisan, Asata, Ogui road di chakoo Lee ka Ahịa Artisan dị n'ụtụtụ ntuliaka ndị ga-achị okpuruọchịchị n'Enugwu N'okpuru ọchịchị Ogwụ N'Ọgwụ ndị nchekwa na ndi ọzọ na-aga ọrụ ntuliaka a ka na-eche iburu akụrụmgwa ha ji aga ọrụ n'ụlọ ọrọ okpuru ọchịchị ahụ. Okpuru ọchịchị Ọgwụ Ndị mmadu na -eburu akụrụmgwa ha ji ahazi vootu n'Ọgwụ Ntuliaka malitere ka o kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihe na Nkwe dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ. Ntuliaka Amalitela na Nkwe di n'okpuru ọchịchi Ọgwụ Na Mpaghara ọwụwa anyanwụ Enugwu steeti Ntuliaka n'Enugwu East na-aga nke ọma oge BBC rutere na ogige ahụ. Mmadụ anọ na-achịkọta ogige ntuliaka anọ n'Enugwu East Local gọọmenti Na Amaọrji, akwụrụmgwa eji eme ntuliaka erutela dịka ndị mmadụ na-eso usoro eji eme ya bu ntuliaka. Ebe a na-atụ vootu na Amaorji Otu patị na-azọ ọkwa isioche okpuruọchịchị obodo n'Enugwu Ebe nke abuo BBC gara bụ ""New Haven Primary School"" ebe ogige vootu asatọ dirila njikere imalite ntuliaka. Ụlọakwụkwụ Praịmarị nke New Haven Foto ndị e tinyere na Facebook na-egosi ebe Gọvanọ Ugwuanyi na-atu vootu n'obodo ya bụ Ohom Orba dị n'okpuru ọchịchi Udenu. Dị ka o si gaa, ntuliaka okpuru ọchịchị ime obodo Enugwu mere n'udo. Ndị ọrụ ntuliaka n'ebe a na-chịkọta vootu na Enugwu nọt. Ndị orụ Enugu state independent Electoral commission Ensiec chikọbara ya bụ ntuliaka ejirila nwayọ nwayọ n'ebubata akwụkwọ ejiri tụọ votu. Ndị gara ọrụ ntuliaka n'Enugwu Nọt Ndị ọrụ Ensiec amalitela Collation n'Enugwu north LGA Nchịkọta Ndị haziri ntụlkịaka na-eme nchịkọta Ndị haziri ntụlkịaka na-eme nchịkọta Ndị haziri ntụlkịaka na-eme nchịkọta Election local gọmenti akwụsịla ugbua n'EnugwuNdị orụ Enugu state independent Electoral commission Ensiec chikọbara ya bụ ntuliaka ejirila nwayọ nwayọ n'ebubata akwụkwọ ejiri tụọ votu.N'Enugwu north Local.Ugbua 'collation' amalitela na ọtụtụ local gọmenti n'Enugwu" 44372822,https://www.bbc.com/igbo/44372822,Agụiyi egbuola ụkọchukwu na-eme mmiri chukwu,Agụiyi adọgbuola ụkọchukwu na-eme ndị ụka ya mmirichukwu n'akụkụ ezu na mba Etiopịa.,"Agụiyi na-ebi na ezu ụfọdụ Akụkọ sị na'aka ndị uweojii na ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na agụiyi dọgburu Pastọ Docho Eshete ka ọ na-eme ndị otu ya mmirichukwu na nsọ ezu dị n'ugwu mba Etiopịa. Ha gwara BBC na ụkọchkwu ahụ na-eme ihe ruru mmadụ 80 mmirichukwu ụtụtụ ụbọchị ụka oge ọdachi ahụ mere na mpaghara obodo Arba Minch dị na Merkeb Tabya districktị. Otu onye bi ebe ahụ aha ya bụ Ketema kairo gwara BBC sị, ""O mere onye mbụ mmirirchukwu, gafe n'onye nke abụọ. Na ntụmadị, agụiyi wụpụtara site n'ezu, nwụchie onye ụkọchukwu ma kwatuo onye ọ na-eme mmirichukwu."" Otu onye uweojii a kpọrọ Eiwnetu Kanko kọwara na ndị bi na-ebe ahụ na ndị ọkụazụ gbara mbọ iji zọọ Pastọ Docho mana mbọ ha amịtaghị mkpụrụ. Eiwnetu si, ""Ha gbalịrị nweta ozu ya... mana ha enwenwụghị ike zọọ ya."" Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51681041,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51681041,Sex Education: Lekwa ihe anọ ga-eme ka nwaanyị gbajọọ inwe mmekọ,Mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-atọwa ntị ma ihe niile dabaa ọfụma.,"Mana kedụ ihe ndị gbasara ahụike nwereike ime ka ya bụ nsori kụọ ingin tụmadi n'ebe ụmụnwaanyị nọ? Dọkịta na-ahụ maka ihe gbasara ime ahụ nwoke na nwaanyị bụ Gabriel Ogah kwuru na nsori anaghị amasị ụmụnwaanyị sitere na pasenti iri atọ ruo pasenti iri ise. Lekwa nsogbu anọ ọ gwara anyị nwereike ike ime ka nwaanyị gbajọ nsori. 1) Ndatu mmụọ Dọkịta Ogah kwuru na ọtụtụ ihe dịka enweghị obi ụtọ maọbụ echiche gbasara ihe dị icheiche ọ na-agabiga nwere ike ime ka nwaanyị kwachapụ nsori. Ihe ọdachị a gụnyere enweghị ego, ihe ndị na-amasị ya maọbụ ụfụ ahụ. 2) 'Hormonal Imbalance' Nke a na-esite n'ọnọdụ ahụ. Dọkịta Ogah kwuru na ihe dịka nwaanyị na anaghị ahụzi nsọ ya ga na-enwe ntachị ọtụ maọbụ ọtụ kpọrọ nkụ nke ga-eme na onye nke ya kpọ oku maka nsori ọ gbajọ ya. Dr Ọgah kwuru na ụmụagbọghọ nwere orịa n'ike, maọbụ ihe na-agbakasi ha ahụ dịka ọtụ basara abasa (wide vagina) nwere ike ha agaghị ekwe enye onye nke ha nsori. 3) Oria Ọtụ Ihe osise iji gosipụta nwaanyị nọ na nsọ Nwaanyị na-arịa ọria ọtụ ndị a agaghị ekwe nwoke rịbanye n'ọtụ ha. Dọkita Ogah gụpụtara ọrịa ndị a dịka igba ọbara n'ọtụ, akpa mamịrị na-ehi ehi maọbụ akpa nwa si n'ike ayọpụta. 4) Ọrịa echiche Nke a na-atọ ọchị mana nwanne eziokwu dị n'ime ya. Dọkịta Ogah kwuru na nwaanyị di ya ji ezigbo ego anaghị eche ka arịọ ya maka nsori mana nwaanyi na-eche maka ego o ga-eji gbo mkpa dị iche iche na-akpa ya ga gba ọsọ nsorị. O kwukwara na nwaanyị nwere echiche maka ụfụ nsori na-enye ya maka ọtụ ya tachiri atachị agaghị emepe ụkwụ ya mgbe ọbụla onye nke ya chọrọ isuturu ya. Ọnọdụ ndị a abụghị ebe ụwa jedebere makana ọgwụgwọ dị. Dọkịta Ogah kwuru na ọgwụgwọ nke mbụ bụ ị ga-ahụ dọkịta ma anya ọria nke na-arịa onye. Nke abụọ bụrụ ọgwụgwọ nwoke igbali rụta n'ọrụ ihe ndịa ahụ nwereike ime ka nwaanyị ya chekasịwa echịche ma o na-eri nsori. N'okwu ya , ego di, ihe niile na ga siriri werere, nwoke na nwaanyị ga-an apia ọkụ mgbe ọbụla mana ọ bụrụ na ihe ndịa adịghị, ihe nsori ga-adị ha ka akụkọ Mike Ejeagha. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Physiotherapy: onye nwere nkwarụ na-agba ọkpụkpụ" 45052374,https://www.bbc.com/igbo/45052374,Lee ihe ụmụ Igbo sị ha ga-ekwu ma ha zute Nnamdi Kanu n'ụzọ,Nnyocha BBC Igbo mere ndị mmadụ na Facebook egosila na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eji Nnamdi Kanu egwu egwu.,"A hụbeghikwa nne na nna Nnamdi Kanu kemgbe Septemba 2017 ndị agha Naịjirịa mere 'Operation Python Dance' n'ụlọ ha. Nnyocha a gosikwara na ebe ụfọdụ na-ahụta ya dịka 'onye amụma', ndị ọzọ na-ahụta ya dịka onye duhiere ndị mmadụ. Cheta na nwunye Kanu bụ Uchechi Okwu-Kanu, gwara BBC Igbo na ọ maghị ebe di ya nọ. Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ BBC Igbo jụrụ ihe ndị mmadụ ga-agwa Kanu ma ọ bụrụ na e nwee ka ha si zute ya n'ụzọ, ha kwuru ọtụtụ ihe gụnyere na ha 'ga-eyipu uwe ha tụọ n'ala ka o nwee ike zọọ ya ụkwụ gafere'. Cheta na ọ gafeela ọnwa 10 a hụrụ Nnamdi Kanu na nne na nna ya n'ihu ọha kemgbe ndị agha Naịjirịa gbachara ""Egwu Eke"" n'ụlọ ha dị n'obodo Afara Ukwu, Abịa steeti. Ịza ajụjụ BBC jụrụ, ụfọdụ kwuru na amụma Kanu buru n'isi Naịjirịa na-abịa na mmezu. Ndị kwụ ya n'azụ Ọtụtụ kwụ ya n'azụ, ma kwuo na ọ ga-ebutere ha mmeri site na ime ka Biafra bịa na mmezu. Ụfọdụ sị na ha ga-ekpere ya ekpere Ndị akwadoghị ya Karis Chidalu kwuru sị ""M ga-ahapụ ya gafere, ọ butela ọtụtụ nkwafu ọbara nakwa mmefu ndụ ndị aka ha dị ọcha nke na-enweghị mmekwata maọlị. Lee etu ndị mmadụ si zaa ajụjụ a na Facebook Lekwa ihe ndị mmadụ kwuru n'Instagram: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-55149981,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55149981,Ọ bụ eziokwu na Umahi chụrụ ndị otu ya na-arụ ọrụ n'okpuruọchịchị Anyim Pius?,"Gọvanọ David Umahi achụọla ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n'okpuruọchịchị Ivo dị na steeti ya, ma sị ha chịpụta akwụkwọ gọọmentị niile dị ha n'aka ozugbo.","Ọchụchụ a metụtara ndị na-arụ n'ebe gọọmentị mapụtara maka mmepe obodo nke a kpọrọ ""development center"" na Bekee, ndị enyemaka, ndị enyemaka pụrụ iche, nakwa ndị ọzọ. Ozi gbasara ọchụchụ ha si n'aka Kenneth Ugbala bụ odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ, onye dere sị ""N'ịkwụnyere ọchịchị ga-anabata mmadụ niile nke Bekee kpọrọ ""inclusive governance"", Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Ichie David Umahi ebinyela aka n'akwụkwọ ka a chụọ ndị ọrụ ndị enyemaka, ndị enyemaka pụrụ iche, ndị ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ụlọ ọrụ na ụlọ ọrụ nakwa ndị ọrụ ndị ọzọ si n'okpuruọchịchị Ivo."" Okpuruọchịchị Ivo bụ ebe Anyim Pius Anyim bụbu onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ onye ya na Gọvanọ Umahi nwere esemokwu, si. Nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ihe na-erughi otu izu Gọvanọ Umahi na-achụ ndị ọrụ ya, dịka ọ chụrụ ndị nke na-arụ n'okpuruọchịchị Ohaukwu bụ ebe Sam Egwu si, n'izu gara aga. 'Mmekọrịta Gọvanọ Umahi, Anyim Pius na Sam Egwu dịbu ka nnu na mmanụ tupu ha esewe okwu a' Ụfọdụ ndị Ebonyi steeti na-atụ ụjọ ka esemokwu dị n'etiti Gọvanọ Dave Umahi, Anyim Pius Anyim bụ Onye bụbu Odeakwụkwọ Ukwu Naịjirịa na Sam Egwu, aka chịbụru Ebonyi, ghara ikpalite tigbuo-zọgbuo na steeti ahụ. Nke a na-abịa dịka Anyim na Egwu bụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti sara Gọvanọ Umahi okwu n'ebubo o boro ha na ha chọrọ ikposa udo steeti ahụ. Kingsley Amaechi bụ onye ọrụ na-eru n'okwu n'Ebonyi steeti kwuru na esemokwu mmadụ atọ a tụrụ ha n'anya n'ihi na ""mmekọrịta ha dị ka nnu na mmanụ"". ""Ọ dị ole na ole bụ ọgbakọ a ga-enwe ị na-agaghị ahụ ndị a ọ kachasị Sinetọ Sam Egwu. Tupu ugbua (esemokwu ha), gọvanọ na-akpọta ha abụọ dịka ndị bụ nna na a na-akwanyere ugwu na steeti a."" O kwuru na mmadụ abụọ a kwadokwara ọchịchị Umahi nke ọma, tupu esemokwu ha adapụta. O kwuru na ọ bụ ""ọchịchọ nke onwe"" bụ ihe butere esemokwu n'etiti ndị a nwere agba n'ọchịchị Ebonyi steeti. Amaechi na-atụ uche na ọ bụrụ na-ekwọghị mmiri oge ọ ka nọ n'obi ọkpa, nsogbu ịkpalite mụọ ndị omekome ịmalite mebiewa ihe ma gbuwe ndị mmadụ mmadụ n'ihi ndị kwe na ndị ekweghị. Amaechi kwuru na ha ndị steeti Ebonyi nwere olileanya ma na-arịọ ka udo chịa na steeti ahụ, ka ọgbaghara ghara ịdapụta n'ihi okwu si mmadụ atọ a n'ọnụ. N'otu aka ahụ, otu jịkọrọ ndị ụka Kraisti bụ CAN ngalaba nke Ebonyi steeti na-arịọkwa ka ek[pee udo iji gbalaụ tigbuo-zọgbuo na mmebi akụnaụba nwere ike ịdapụta ma ọ bụrụ na edozighị okwu ahụ. Ebe Anyim kwụ Anyim Pius Anyim bụbu onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjiria n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan N'ọsịsa ya, Anyim bụbu odeakwụkwọ gọomentị Naịjiria degaara onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị isi ụlọọrụ nchekwa akwụkwọ ozi, ebe o kwuru na Umahi bụ onye anyaukwu nakwa onye oke ọchịchọ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na mmehie kacha njọ Umahi mere bụ ịkpọ ya na ụmụ Ebonyi ndị ọzọ garala obodo ha ozi, aha ọjọọ iji kparịa ha. O kwuru na Umahi dị ka onye mmiri na-eri na-achọ onye ga-eso ya daa mmiri. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, o kwuputekwara etu Umahi si gbata n'ụlọ ya ịbịa rịọ ya ka o soro ya gafee pati All Progressives Congress (APC) dịka o si na People's Democratic Party (PDP) pụọ, mana ọ jụrụ ajụ; o kwuru na ọ bụ ya mere o ji akpọ ya bụ Anyim aha ọjọọ. Ebe Egwu kwụ Dkt Sam Egwu bụbụ aka chiburu Ebonyi steeti ma jidebuo ọkwa mịnịsta agụmakwụkwọ N'aka nke ya, Egwu bụbu gọvanọ Ebonyi steeti nakwa minista agụmakwụkwọ na Naịjiria, sara ebubo Umahi sị na ya bụ ebubo anaghị echekasị ya. O kwuru sị ka ndị nchekwa nwụchie ya bụ Egwu ma ọ bụrụ na o nwetula mgbe o kwutere okwu maọbụ nọrọ n'ọgbakọ ebe a nọ kpaa nkata maka iweta ọgbaghara na steeti ahụ. O kwuru sị na ọ ghọtaghị etu ọ ga-esi kpaa nkata iweta ọgbaghara na steeti ọ chịburu. O kwuru na onye ọbụla nwere ikike ịgafe pati ọbụla sọrọ ya, ma kwuo na ọ bụghị ihe ọjọọ na ha abụọ anọkọghị n'otu pati." afirika-51372247,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51372247,Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 - Inec,Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (Inec) ewetuola ọnụọgụgụ otu pati nọ na Naịjirịa site n'iri itoolu na abụọ ruo iri na asatọ.,"Onye kwuru nke a bụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu n'Abuja taa bụ ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị, 2020. N'ọgbakọ ha nwere n'Abuja taa, Inec kwuputara ka ihe siri kwụrụ n'ọnọdụ otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ya na ka ụbọchị ntuliaka ndị gọvanọ na-abịa ga-esi gaa n'Edo na Ondo steeti. Okwu ha metụtakwara ndọrọndọrọ ọchịchị ndị nke fọrọ na steeti dị icheiche akpọrọ ""by-election' na Bekee. Dịka ọrụ nchịkọta pati ndọrọndọro ọchịchị si dị n'aka Inec, ha kwuru na ọ bụ pati iri itoolu na abụọ (92) bụ ihe dị n'akwụkwọ ha mgbe e mere ndọrọndọro nke 2019. Onyeisi Inec kwukwara na akwụkwọ iwu nyekwara ha ikike iwepụ pati ọbụla ụkwụ esighi ike n'ala, dịka; Pati na-ewetezughị ihe a chọrọ mgbe ha debara aha n'akwụkwọ. Pati na-enwetezughị ihe ruru vootu ruru pasentị 25 mgbe e mere ntuliaka onyeisiala na steeti ọbụla. Pati enweteghị mmeri n'otu wọọdụ mgbe e mere ntuliaka onyeisioche okpuru ọchịchị. Pati na-enweteghị otu oche n'ọgbakọ ụlọomeiwu maọbụ nke nnọchiteanya imeobodo. Ihe ndị a ka Inec lebachara anya wee kpochapụ pati 92 ahụ hapụzịa naanị 18 dịka ndị ụkwụ siri ike n'ala. Pati ndị a hapụrụ gụnyere: Booty Party (BP) na Action People's Party (APP) ka nwere ihe ọ fọrọ tupu ha etozuo oke wee banye n'ọnụọgụgụ. Nke a pụtara na pati dị iri asaa na anọ (74) esoghizi n'ọnụọgụgụ na Naịjirịa. Ọzọ, Inec mere ka ndị mmadụ mata na ntuliaka nke gọvanọ n'Edo steeti ga-abụ na Satọde, ụbọchị nke iri na itoolu nke ọnwa Septemba (19/09/2020), ebe nke Ondo ga-abụ na Satọde ụbọchị iri nke ọnwa Ọ‘ktoba afọ 2020(10/10/2020). Usoro ntuliaka ndị a dị n'akara soshal midia ha. Yakubu jikwa ọnọdụ ahụ dọọ aka na ntị maka ndị na-ebute ọgbaaghara na ntuliaka ọbụla ka ha kpachara anya ha. Akụkọ ga-amasị gị" 54250085,https://www.bbc.com/igbo/54250085,Real estate : Ị na-achọ ịzụ ala maọbụ ụlọ? Lee ihe asaa i kwesiri ime iji gbalahụ okwu na ụka,Victoria Okonkwo( ọ bụghị eziaha ya) na di ya tụkọrọ ego zụọ ala.,"Oge di ya nwụrụ, Victoria kwachara di ya, chọwa akwụkwọ ala ha zụrụ, ọ hụghị ya. Ọ gara n'ụlọikpe nweta akwụkwọ akaebe n'akwụkwọ ụlọ ya furu efu. Mana oge ọ malitere iwu ụlọ n'ala ahụ maka obibi ya na ụmụ di ya hapụrụ ya, Ogbonna Nwafor (ọ bụghị ezi aha ya) bịara gwa ya wepụ aka n'ala ahụ na ọ bụ ya nwee ala ahụ, na nwa di ya resiri ya ala. Okonkwo gwara ya na o nweghị onye ọzọ ya resiri ala, Okwu ahụ pụrụ ụlọikpe bụ ebe ọ pụtara ihe na Nwafor zụrụ ala n'aka ya enweghị ikike ire ala ahụ ebe a gwara ya gaa n'aka onye ahụ narakwa ego ya. Ị na-eche maka ịzụ ụlọ? Ị tụkọtala ego gbara ọkpụrụkpụ mana tupu ịzọpụ ije ịzụ ala maọbụ ụlọ? Cheta na ọ dị oke mkpa ike nkwụcha ka ị ghara ịkwọ aka tiere ọkụkọ akụ n'ihi na ịzụ ala maọbụ ụlọ abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba. Ndị mmadụ abụọ bụ ọkachamara n'ihe gbasara ala na ewumewu; Ayo Akinwale, onye bụ ihe Bekee ""real esate surveyor"" na Obinna Ogbukiri bụ onye 'architect gbara ndị chọrọ itinye ego n'ala ama ka ha jụọ ese. Lee ese asaa ndị i kwesịrị ịjụ maọbụ ihe ị ga-eme tupu ị zụọ ala maọbụ ụlọ dịka ha si rụtụ aka: 1. Onye nwe ala? Ala ị chọrọ ịzụ ọ bụ nke ogbe ka ọ bụ nke otu onye nwe? Ya bụ ajụjụ mbụ dị oke mkpa ị jụ ndị nwe ala ahụ. Dịka Akinwale na Ogbukiri si kọwa, ọ dị mma ịchọpụta maọbụ ala obodo maọbụ, otu onye nwe iji mara ma onye chọrọ iresi gị ala o nwere ikike ire ya. Ọ bụrụ ala obodo maọbụ ihe karịrị otu onye nwe, eze obodo maọbụ ndị gbakọrọ aka nwere ya ga-ebinye aka n'akwụkwọ tupu e ree ya. E meghị etu ahụ, ị mara na mmiri nwere ike ịma ehi n'anya n'ọdịnihu. Ogbukiri, onye nwe ụlọọrụ Cartouche Shelters Owere kọwara sị, ""ịzụ ala dịka ịlụ nwaanyị, anaghị e ji ọsọ achụ ya. Ọ dị mma ime nnyọcha i kwesịrị ime."" 2. Kedụ ihe gọọmenti mabụtara mpaghara ebe ị chọrọ ịzụ ala ka ọ bụrụ? Akinwale na Ogbukiri kwuru na ihe dị mkpa ịchọpụta bụ ma e nwere ihe gọọmenti mapụtara mpaghara ebe ịzụ ala ka e were ya mee. A na-enwe ebe gọọmenti mapụtara maka ebe obibi, nwee ebe a mapụtara maka ụlọọrụ maọbụ ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa. Iji maa atụ, Ogbukiri si,""E nwere ala n'Owere ebe ndị mmadụ bụ ebe amapụtara maka ụgbọoloko mana ndị mmadụ ruru anọ azụọla ya n'ihi n'ala ahụ dị ebe dị mma."" ""Ị ga-ebe e mewere maka ịwu ụlọ ana-emepụta ngwa ahịa, ị ga-azụọ ala maka obibi na-ụdị ebe ahụ, ị ga-adanye na nsogbu."" 3. Okwu ala ahụ ọ dị n'ụlọikpe? Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Ịzụ ala okwu ya dị n'ụlọikpe bụ iji aka gị kotere onwe gị nsogbu. Gba mbọ mee nchọpụta ka ị ghara ibe ""m gara mara."" 4. Kedụ ka ntọala ụlọ ahụ siri kwụrụ? Akinwale si na ọ dị mkpa itule ma ntọala ụlọ ị chọrọ izu ọ kwụsikwara ike. Ọ sị, ""Onye injinia bụ ọkachamara n'ewumewu nke Bekee kpọrọ 'structural engineer bụ onye ị ga-akpọ ka o lere gị ma ụlọ ị chọọ ịzụ ọ kwụ dịka o kwesịrị n'ihi ụfọdụ ụlọ enweghị ezi ntọala.' Ụfọdụ ndị ji anya okenye ahụ ihe dara mmiri ga-agwa gị n'ọdị mma ile ala oge udummiri. Ogbukiri tụpenyere gị azụ sị gị ""gaa were anya gị hụ ebe ị chọrọ ịzụ. Ọhịa dị ya, sụọ ya."" "" Ọ bụrụ ala onye ọzọ, onye nwe ya ga-apụta jụọ gị onye dunyere gị sụwa ala ya."" 5. Ụlọ ahụ enwere nkwado ""Town Planning""? I nwere ike iji nde naira ise(N5m) rụta ụlọ ala dị mma Akinwale kwuru na ọ dị mkpa ịmata ma ụlọ ị chọrọ ịzụ ọ gbaso nhazi obodo(Town planning) dịka gọọmenti sị kwado ya. Ọ bụrụ n'ụlọ dị n'ebe ọwammiri kwesiri ịdị, maọbụ n'ebe ekwesịrị ịwa okporoụzọ, gọọmenti nwere ike ikutu ụlọ ahụ oge ị tụghị anya. 6. Ị gbakọ aka zụ ala ka ọ bụ ịzụrụ onwe onye? Akinwale kwuru na ha abụọ nwere uru na ọghọm dị ya. ""Ị zụọ nke onye nwe ala(ọmọnile), ọ dị mkpa ịgba ọsọ ga tinye aha ala ahụ na gọọmenti n'ihi na ọ bụ onye bụ ụzọ denye aha ala ahụ ka gọọmenti ma dịka onye nwe ala."" Nke a bụ n'ihi na i meghị otu ahụ, ha nwere ike resikwa onye ọzọ otu ala ahụ. Akinwale kwuru na ọ bụrụ na ị bụ onye banyere ọhụrụ n' itinye ego n'ịzụ ala, ịzụ ala ebe a gbakọrọ aka nwee ala nke Bekee kpọrọ 'estate' kacha mma karịa nke onye. Nke a bụ n'ihi na n'agbanyeghị na dị ala ahụ na-adị oke ọnụ karịa, ha na-enwe ezi nchekwa, ebe ndị hiwere ya na-etinye okporoụzọ, ọwammiri ma nwetakwa ikike ala ahụ n'aka gọọmenti. Mana onye nwee ala ga-ersị gị ọnuala mana o nweghị ihe nhazi ọbụla ọ ga-etinyere gị nke ọ na-enwe ezi nchekwa. 7. Chọọ onye ọkachamara n'ihe gbasara ala nke Bekee kpọrọ 'estate surveyor' v Nke a ga-egboro gị mkpa bido na ese mbụ rue nke isii. Onye 'estate surveyor' aha ya dị n'akwụkwọ ndị otu ahụ bụ onye nwere ọzụzụ maka ihe niile gbasara ala maọbụ marakwanụ onye maọbụ onye ihe gbasara ala dị n'aka. Akinwale, onye bụ 'Estate Surveyor' sị, na"" ọ bụ ya ga-enyere aka ịdụ gị ọdụ ihe kwesiri ịchọpụta maka ala maọbụ ụlọ ị chọọ ịzụ. Cheta na ndị etinyeghị anya na mmiri were zụọ ala ga-ebe ka nwata tara ose ma ha danye na nsogbu maka akwụgbughị ajụgbu were eri. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-51665152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51665152,"Nigerian foods: Onye ọnụ ụtọ, lee etu ị ga-esi sie ụkwa gị ka ọ dọọ ndị ọzọ akpịrị","Nri dị nri a dịrị, mana ụkwa so na nri ndị e nwereike ịkpọ 'igwe' n'ala Naịjirịa ọkachasị ala Igbo.","Ọtụtụ ndị na-atụnyere ụkwa na agwa, mana ha abụghị nwanne nke e ji esi otu ụzọ eri ya. Ebe e nwereike isi ụkwa na-etinyeghi nnu na ose nakwa ṅụọ mmiri ya, anaghị eme agwa etu ahụ n'ihi na ọ ga-enwerịrị ihe e ji elofe agwa. Ebe ụkwa bụ nri e ji mara ndị Igbo, etu anyị si esi ya emeela ka ọ na-adọ ụfọdụ ndị agbụrụ ọzọ akpịrị. Lee ụzọ ndị ị ga-esi rie ụkwa gị ọ banye ndị ọzọ n'anya: 1) Ụkwa a gwọrọ agwọ: Nwanne ọ bụrụ na ị ritubeghị ụkwa e nye gị nke a, ị ga-ericha ya ma taa efere gị. Ụkwa e ji naanị mmanụ nri e tinyere ose na nnu sie na-atọwa ntị, ọkachasị e sichaa ya ka o dee ede. Ị tụkwasịzịe ya azụ ọkpọọ maọbụ okporoko ị mara na ị garuola 'Galilee'. 2) Ụkwa e tinyere ọka: Nwanne i ritula ụkwa e tinyere ọka e siri esi? Kedụ etu ụbụrụ gị si nabata ya? Isi ọ gbara gị ka 'popcorn' mgbe ị kunyere ya n'ọnụ gị? Ụdịrị ụtọ ụkwa a na-atọ abụghị ihe e kwesịrị ịkọrọ gị akọrọ; ọ bụ ihe ị kwesịrị iji aka gị nwalee ma gbaa ama. 3) Ụkwa e tinyere akwụkwọ nri Ndị Enugwu-Ukwu unu anọkwa ya eh? Nwanne i ritula ụkwa ndị obodo a siri? A ga-eji gị eji igbochi gị ilo ngaji i ji rie nri gị. Ọ naghị amachakwa mma n'anya ma ha sichaa ya, mana i detu ya ọnụ, ị mara na ụwa bụ mmịmị. Ha na-etinye ya akwụkwọ nri, azụ ọkpọ, okporoko, ogiri, nnu, nakwa ose. Kedụ ndị ọzọ ị ma na-esi etu a esi nke ha? 4) Ụkwa a na-etinyeghi ihe ọbụla Ụfọdụ obodo ịma atụ, Urualla, anaghị etinyekarị ihe ọbụla n'ime ụkwa ha. Ị makwa na ha ejighikwa ịṅụ mmiri ụkwa egwu egwu? Mgbe ha ga-esi ya etu a, ha anaghị etinye ya nnu, ose maọbụ ihe ọbụla chaa chaa. Ịgwa gị eziokwu, ọ na-atọwakwa agba etu a. Detu ya ọnụ ka ị gwa anyị ihe ị gatara. 4) Ụkwa e ghere eghe: Ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ụkwa eghere eghe atagharị ọnụ Ọ bụrụ na ị tatubeghi ụkwa e ghere eghe, ị mazịkwa nke ekwe na-akụ? Ụfọdụ na-ekwu na ọ na-atọ ka ọpụpa/ahụekere, mana ngwa gị onye tatụrụla ya gwa anyị, ọ bụ eziokwu? Ụkwa e ghere eghe na-atọ ezigbo ụtọ ma i jiri akịoyibo maọbụ akị e tiri eti takọọ ya. Kedụ etu e si esi ụkwa? Ihe ndị e ji esi ụkwa gụnyere ose, nnu, mmanụ nri, ụfọdụ na-etinye ogiri, ụfọdụ na-etinye azụ dị iche iche, ụfọdụ na-etinye ọka, akanwụ, ngọ nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ime ka o ghee ọsịsọ. Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu i sie ụkwa gị: E nwere ụzọ ọzọ i si esi ụkwa gị na-adịghị ebe a? Ngwa gwa anyị. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Food vendor: Ndị mba ọzọ na-abọ nri ma abọ karịa ndi Naịjirịa" afirika-52396607,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52396607,Coronavirus Have Your Say: Anyị ga-ahụ na ego mba ụwa kere ga-eruteriri ala Igbo - Kọmịshọna ahụike Enugu,Kọmishọna ahụike n'Enugwu steeti bụ Ikechukwu Obi ekwuola na ha agaghị ekwe ka ego ndị mba ụwa nyere Naịjirịa iji nye aka maka ọrịa coronavirus ghara irute ala Igbo aka.,"Ndị na-akwado ihe enyemaka ha ga-eke ndị mmadụ n'ihi ọịa coronavirus Dọkịta Obi kwuru na gọọmentị ga-agbalị ike ya niile ịhụ na ndị mmadụ atagbughị onwe ha n'ahụhụ n'oge a akpọchiri ebe niile. Na mkparịtaụka ahụ, Obi kọwakwara na gọọmentị na-agbaso atụmatụ mgbochi ọrịa karịa ịgwọ ya agwọ. O kwuru nke a oge otu onye jụrụ ya ma gọọmenti ọ ga-agbaso atụmatụ Bekee kpọrọ 'herd immunity' iji mara ma a ga-emeri ọrịa ọjọọ a bụ covid-19 'Herd immunity' bụ atụmatụ ịhapụ ka ọrịa fee ọtụtụ ndị mmadụ iji mee ka ihe na-ebuso nje agha n'ahụ mmadụ bụ 'immunity' gbalie ma busowe ya bụ ọrịa agha. Obi kọwara na 'herd immunity' agaghị arụ ọrụ maka coronavirus n'ihi na ya bụ ọrịa na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ. Lee mkparịtaụka anyị na ha ebe a: Etu Anambra si gwọta onye nwere coronavirus n'Anambra steeti Anyị mere ihe niile WHO nyere ka usoro e ji agwọta ndị bu nje coronavirus. Kọmishọna ahụ ike n'Anambra steeti bụ Vincent Okpala ekwuola na ngalaba ahụike steeti ahụ sonyere atụmaatụ niile Nigeria Center For Disease Control wepụtara eji a gwọ nje coronavirus. Lee mkparịtaụka nke nke anyị na Kọmịshọna Anambra steeti, Dr. Vincent Okpala na-akpa maka etu ha siri gwọta onye nwere nje maka Coronavirus. Dr. Okpala jikwara ohere a bugharịa na 'Isolation center', wee gosi BBC Igbo ebe ha na-ebuba ndị mmadụ. Kirie ya ebe a:" afirika-52719366,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52719366,President Buhari: Gịnị kpatara Buhari anaghị ekpu 'mask'?,Otu iwu nke gọọmentị etiti tiri iji nye aka n'igbochi mfesa ọrịa coronavirus bụ na onye ọbụla ga na-ekpuchi ihu ya mgbe ọbụla.,"Buhari anaghị ekpuchi ihu ya ma ya na ndị ọzọ na-enwe nzukọ Nke a gụnyere mgbe onye ahụ chọrọ ịpụ ezi maọbụ mgbe ya na ndị mmadụ nọ. Mana onyeisiala Muhammadu Buhari anaghị eme nke a. Ọtụtụ oge ka onyonyoo Buhari pụtara ebe ya na ndị mmadụ na-eme nzukọ mana ọ gaghị ekpuchi ihu n'agbanyeghi na ndị ọzọ ga-ekpuchicha ihu ha. Buhari ọ bụzị o tiri iwu ada iwu? Oge Buhari nabatara ndị kọmiti o hibere maka ibuso ọrịa coronavirus agha na Naịjirịa Mana ụlọọrụ onyeisiala akọwaala ụfọdụ ihe mere onyeisiala ejighi ekpuchi ihu ya mgbe ya na ndị ọzọ nwere nzụkọ Bashir Ahmad bụ onye na-enyere Buhari maka mgbasa ozi soshal midia gwara BBC na onweghi ọrịa ga-efe onyeisiala n'ihi na ndị niile nọ ya n'akụkụ na-ekpuchi ihu ha oge niile. O kwuru sị: ""Nke mbụ bụ na ọbụghị Buhari bụ onyeisiala na-anaghị ekpuchi ihu ya. TY Danjuma na Buhari nwere ọgbakọ n'Aso Rock na Mọnde, abalị 18 nke ọnwa Mee 2020 ""Ị ga-ahụ na ọtụtụ ndị ọchịchị na mba dị icheiche anaghị ekpuchi ihu ha"" ka o kwuru. ""Ọzọ bụ na ebe ọbụla onyeisiala nọ, ị ga-ahụ na onye ọbụla nọdebere ya kpuchiri ihu ha. ""Otu ahụike mbaụwa kwukwara na otu onye nwere ike ịhapụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ndị niile nọ nso kpuchiri ihu ha."" Onye ọzọ kwa na-arụrụ onyeisiala ọrụ aha ya bụ lauretta Onochie kọwakwara nke a n'akara Twitter ya. Ndị nkịtị kwanụ? Ndị uweojii na-amanye ndị mmadụ ka ha kpuchie ihu ha Ọtụtụ oge ka ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa na-enye ndị mmadụ nsogbu maka ekpuchighi ihu. Oge ụfọdụ, ha na-amanye onye naanị ya nọ n'ime ụgbọala ka o kpuchie ihu, n'agbanyeghi na o nweghi onye ya na ya nọ n'ime ụgbọala ahụ. Nke a ebutela ọtụtụ nghọtahie n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị mmadụ nkịtị. Gịnị ka WHO kwuru gbasara 'face mask'? Covid-19 n'otu nkeji: Facemask ọ na-egbochi mbute coronavirus? Otu 'World Health Organisation' kwuru na ọ dịghị mkpa mmadụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ahụ siri onye ahụ ike. Ha kwuru na ndị kwesịrị ikpuchi ihu bụ ndị ahụ adịghị maọbụ ndị na-eleta ndị ọrịa. Ndị ọchịchị ndị ọzọ na-anaghị ekpuchi ihu ha Donald Trump anaghị ekpuchi ihu ya N'ezie, ọ bụghị naanị Buhari bụ onye ọchịchị na-anaghị ekpuchi ihu ya n'ọgbakọ ọha mmadụ. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na osote ya bụ Mike Pence anaghị ekpuchi ha. Boris Johnson na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ọnwa March Boris Johnson, Praịm Mịnịsta mba Briten, bụ onye rịara ọrịa coronavirus ma mechaa gbakee, anaghịkwa ekpuchi ihu. Onye ọzọkwa bụ Vladmir Putin nke mba Rọshịa. Mana ị ga-ahụ na ndị niile ha na ha nọ nso anaghị ekpuchikwa ihu ha. Ugbua, dịka ozi pụtara na osote onyeisiala nke mba Saụt Sudan ebutela ọrịa coronavirus, ndị ọkacha mara na-ekwu na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-echekwa onwe ya nke ọma." egwuregwu-46585331,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-46585331,Jose Mourinho: Zinedine Zidane na mmadụ atọ ndị a e nwere ike ịnọchi ya?,Onye nwere ike ịnọchi anya Jose Mourinho ugbua Manchester United chụrụ ya?,"Onye ga-anọchi Mourinho ugbua? N'agbanyeghị na Mourinho chịkọtara ha afọ abụọ na ụma, obi dị ọtụtụ ndị na-akwado Man Utd anụrị na a chụrụ ya, mere ka ha jiri aka ha na-akpọpụta aha ndị ha chọrọ ka ha nọchie ya. Mana otu Man Utd sị ndị mmadụ cheretụ, na ha ga-ahọpụta onye ga na-elekọta otu ha ruo ngwụcha afọ bọọlụ a, tupu ha achọta onye ọ ga-abụzị ọrụ ya ịchịkọta ha. Lee aha mmadụ ole Man Utd nwere ike iwe n'ọrụ dịka onye nchịkọta ha na ngwụcha afọ bọọlụ a. 1) Zinedine Zidane Zidane dị afọ 46 e ji ""Zizou"" mara, so n'ime ndị a na-ahụ ka ""dike"" n'egwuregwu bọọlụ. Zidane enweghị ebe ọ na-achịkọta ugbua. Ọ bụ ya ga-ewe ọrụ a? Ọ bụrụla onye nchịkọta bọọlụ ugbua, ka ọ gbachara bọọlụ ihe karịrị afọ iri atọ na asaa. Dịka onye nchịkọta, ọ chịkọtara otu Real Madrid nke obere site na 2014 ruo 2016 na nke nnukwu site na 2016 ruo 2018. Dịka onye nchịkọta Real Madrid, o buliri iko Uefa Champions League ugboro abụọ, bulie nke La Liga otu oge, bulie Uefa Super Cup ugboro abụọ, otu nke Supercopa de España nakwa nke FIFA Club World Cup ugboro abụọ. 2) Michael Carrick Carrick dị afọ 37, bụ otu onye ma maka Man Utd ọfụma; ọ nọola ebe a hụ dịka onye egwu nakwa onye nchịkọta. Carrick so Man Utd bulie iko iri na asatọ Ọ gbaara Man Utd bọọlụ afọ iri na abụọ, site na 2006 ruo 2018; ọ nọ ya oge Alex Ferguson, David Moyes na Louis Van Gaal. Ka ọ kwụsịrị ịgba bọọlụ, Mourinho kpọrọla ya mee ya otu n'ime osote ya. 3) Antonio Conte Conte dị afọ 49, achịkọtala otu egwuregwu dị ka Juventus, Atalanta nakwa Chelsea. Conte arụbeghị ọrụ onye nchịkọta kemgbe ọ pụrụ na Chelsea Ọ bụkwa otu onye gbachara bọọlụ banye ọrụ nchịkọta. N'agbanyeghị na Chelsea mechara chụọ ya n'ọrụ n'ọnwa Julaị 2018, Conte buteere ha otu iko Premier League na otu iko FA. 4) Mauricio Pochettino Pochettinho dị afọ 46, achịkọtala otu dị ka Espanyol, Southampton na Tottenham. Pochettino achịkọtala Tottenham site n'afọ 2014 ruo ugbua Ọ gbakwara bọọlụ n'otu dịka PSG na Espanyol tupu ọ banye ọrụ nchịkọta. Dịka onye nchịkọta, o nwetala ihe nrite ""onye nchịkọta kachasị mee ọfụma"" na Premier League ugboro anọ. Onye ka ọ dị gị ka ọ ga-aka mee ọfụma ma a họrọ ya?" mba-uba-43806220,https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43806220,Barbara Bush nwunye onye bụbu onyeisiala Amerịka anwụọla n'afọ 92,"Barbara Bush, nwunye onye bụbu onyeisiala nakwa onye na-alụ ọgụ ikwado agụmagụ, anwụọla n'afọ iri itoolu na abụọ (92).","Ọ bụbu nwaanyị ama ama n'ezinaụlọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-adị mma nke mepụtara onyeisiala abụọ - di ya bụ George .H.W. Bush na nwa ya nwoke bụ George .W. Bush. Oriakụ Bush bụbu nwunye onyeisiala site n'afọ 1989 ruo 1993, bidoro ịrịa ọrịa n'oge ole na ole gara aga, ma jụ ịnata ọgwụgwọ ọzọ. Ndị mmadụ ebidola ịgba akaebe ziri ezi maka ndụ ya n'ogige ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Amerịka. Di ya dị afọ iri itoolu na atọ (93) bụ onyeisiala Amerịka kacha biri ndụ. Nwa ha nwoke bụ George, rigoro n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2000 ma chịa ugboro abụọ dịka onyeisiala mba Amerịka nke iri anọ na atọ (43). Ka nne ya nwụrụ, George kwuru sị ""Nne m ọma anwụọla n'afọ iri itoolu na abụọ (92). Ọ na-ewute m na Laura, Barbara na Jenna, mana obi zuru anyị ike maka na anyị na obi zukwara ya ike. Barbara Bush mere ọfụma dịka nwunye onyeisiala, ma nye ndị mmadụ nde kwuru nde ịhụnanya ma gbalịa hụ na ọtụtụ mụtara etu esi agụ ma ede akwụkwọ."" Oriakụ Bush na nwa ya n'afọ 2005 Bush kwuru na nne ya ""Mr Bush said his mother had ""debere anyị na mkpịsị ụkwụ anyị ma kpagide anyị ọchị ruo na ngwụcha"" O kwukwara na ""E nwere m ihu ọma maka na Barbara Bush bụ nne m. Ọ ga-emetụta Ezinaụlọ anyị n'obi ọfụma, anyị na-ekelekwa unu maka ekpere unu nakwa ozi ekele ọma unu."" Nkwuputa si n'ụlọọrụ di ya kọwara ya dịka ""ezigbo onye na-akwado agụmakwụkwọ ezinaụlọ"". Barbara bụkwa nne Jeb Bush nke rụrụ ọrọ ka gọvanọ ndị Florida site n'afọ 1999 ruo n'afọ 2007 ma daa n'ọsọ ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala n'afọ 2016. Oge ọ bụ nwunye onyeisiala, Barbara azaghị 'nwunye onyeisiala' n'ọnụ, ọ gara n'ihu bido otu na-ahụ maka agụmakwụkwọ nke ọ kpọrọ Barbara Bush Foundation for Family Literacy, iji nyere ndị nne na nna nakwa ụmụaka si nọ na mkpa aka ịmụta etu esi agụ ma dee ihe. Nkume Ezinaụlọ Ọ kpara ezigbo ike n'ihe gbasara ikike ndi mmadu ma nupuru ọtụtụ ndị na-akwado di ya n'otu Repụblikan pati isi site n'ebumnuche ya gbasara ikike mmadụ nwere ịwepụ afọ ime. Na nkwuputa onyeisiala Donald Trump, o kwuru na a ga-echeta Oriakụ Bush ogologo oge maka ntinye uchu o tinyere nye mba ya na ezinaụlọ ya, ""abụọ nke o mere ezigbo ọfụma"". George .H.W. Bush na Barbara Bush biri afọ iri asaa na atọ dịka di na nwunye Barack na Michelle Obama kọwara ya dịka ""nkume nke ezinaụlọ tinyere uchu n'ihe gbasara ọrụ ọha na eze"" nakwa ""onye eji ama atụ maka inwe obiumeala na-egosipụta mmụọ ndị mba Amerịka nke kacha mma."" Onyeisiala ọzọ chịbụrụ mba Amerịka bụ Bill Clinton, kwuru na Oriakụ Bush ""kpọrọ akpọ n'ikwado ezinaụlọ ya na ndị enyi ya, mba ya na ihe ndị kwesịrị ekwesị masịrị ya."" O kwuru na ya na nwunye ya bụ Hillary Clinton ""agaghị echefu nkwanye ugwu ya na onyeisiala Bush gosiri anyị"". A ma Oriakụ Bush maka ntutu ya na-enwu ọcha nke mere ezinaụlọ ya ji gụọ ya ""nkịta ọhịa ọlaọcha"" ya bụ ""the silver fox"" na bekee. E nwere oge ọ gọnahụrụ ebubo eboro ya maka ịmetụta etu di ya si arụ ọrụ onyeisiala, nke ọ zara sị ""anaghị m ezuzuru tinye ọnụ m n'ihe gbasara ụlọọrụ ya, ọ naghịkwa etinye ọnụ n'etu m si achịkọta ezinaụlọ m."" Barbara Bush zutere ndị nọ n'ọkwa ọchịchị si na gburugburu mba ụwa oge ọ bụ nwunye onyeisiala Nsonso a, ekwuputara na Barbara jụrụ ịnata ọgwụgwọ ka a gachara ụlọọgwụ ugboro ugboro, mana ekwughị ihe na-arịa ya. O kwuru na ọ chọrọ ibi ọgwụgwụ oge ya 'n'enweghị mgbakasị ahụ"" n'etiti ezinaụlọ ya. Barbara bụ nwa Marvin Pierce bụ onye na-ebiputa magazịn. O toro n'obodo Rye dị na New York. O zutere di ya n'afọ 1941 n'otu ọgbakọ ekeresimesi emere na Connecticut, ya na di ya mere emume ncheta afọ iri asaa na atọ ha birila dịka di na nwaanyị n'ọnwa Jenụwarị nke afọ a. Ha mụtara ụmụ isii nke gụnyere otu nwaanyị akpọrọ Robin, nke ọrịa leukaemia gburu n'afọ 1953 oge ọ dị afọ atọ. Gụnyere George na Jeb, ụmụ ha ndị ọzọ bụ Neil, Marvin na Dorothy. Oriakụ Bush bụ otu n'ime naanị ụmụnwaanyị abụọ ndị di ha na nwa ha mechara bụrụ onyeisiala mba Amerịka, ma bụrụ naanị otu nke hụrụ ka ha abụọ ṅụrụ iyi ọrụ. Onye nke ọzọ bụ Abigail Adams lụrụ onyeisiala mba Amerịka nke abụọ bụ John Adams, ma bụrụkwa nne John Quincy Adams bụ onyeisiala nke isii, n'agbanyeghị na ọ dịghị ndụ ịhụ ka nwa ya rigoro n'ọkwa ọchịchị. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-51890429,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51890429,AMVCA 2020: Ndị meriri na ndị e meriri na'emume nke afọ,Stanley Chibunna eritela nturuugo onye kacha akpa ọchị n'ejije Nollywood.,"Stanley 'Funnybone' Chibunna Chibunna onye e ji Funnybone mara ritere nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' nke afọ 2020. N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya na-echeta nne ya onye nke nwụrụ ọnwa olemole gara aga. Living in Bondage eturula ugo dịka ejije kacha ibe ya mma na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka n'afọ 2019/2020. Ya bụ ejije nwetara nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' e mere n'ụbọchị Satọde. Ejije a bụ mmegharị ejije nke mbụ e ji malite Nollywood bụ nke a kpọkwara 'Living in Bondage'. Onye haziri ejije nke a bụ Ramsey Noah. Ndị ọzọ sokwa mee ya gụnyere Kenneth Okonkwo, Kanayo O. Kanayo, Bob Manuel Udokwu na ndị ọzọ. Nne ritere ntuuruugo maka ejije kacha mma e ji asụsụ Igbo mee BBC Igbo kwụ chịm dịka a na-etunye ndị gbara mbọ na Nollywood ugwu kwesịrị ha. N'ime ntuurugo 26 e wepụtara na AMVCA nke afọ a, naanị asaa ka ndị ọha mmadụ nwere ike ịtụrụ vootu. Lee ka okwe si gbaa: Ihe nkiri a kpọrọ 'Nne' nke Victor Iyke mepụtara, ritere nzere ejije kacha bụ nke e ji asụsụ Igbo mee" afirika-51354209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354209,Rev Emmanuel Obimma kwuru na ọ ma na 'wayo' ga-abanye n'ikpe Hope Uzodinma,Rev. Fr. Emmanuel Obimma a ma dịka Ebube Mmụọnsọ kwuru obi ya maka ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya ugbua.,"' Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ Fada Obimma nke Holy Ghost Adoration Mịnịstrị dị n'Anambara steeti, kwuru na o cheghi na okwu gbasara IPOB gaara apụta ihe ma ọ bụrụ na ọnọdụ Naịjirịa dị mma. O kwukwara sị na ""anaghị ere amụma ere. Ọnụ ụkọchukwu na-ebu amụma"", ka a jụrụ ya ihe o chere banyere amụma Fada Ejike Mbaka buru n'isi Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti. N'etu ikpe ahụ si dapụta, Fada Obimma kwukwara sị na ọ ma na ""aghụghọ ga-abanye n'ime mkpebi ikpe ahụ"". Lee ihe nkiri a ka ị chọpụta ihe ndị ọzọ o kwuru. Akụkọ a ga-amasị gị:" 48529719,https://www.bbc.com/igbo/48529719,Ihedioha Vs Okorocha: Ụjọ nnyocha adịghị atụ m - Rochas,Onye chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ụjọ ọbụla anaghị atụ ya banyere nnyocha nke Emeka Ihedioha bụ onye na-achị Imo ugbua sị na ya ga-enyocha ọchịchị ya.,"Rochas Okorocha chịri steeti Imo afọ asatọ Ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Ebere Nzewuji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Wenezdee. N'ụbọchị Tuzdee, Ihedioha kwuru na ya ga-enyocha ndị ọchịchị Imo steeti garala aga ma gbaa nke ọbụla n'ime ha zuru ego steeti ahụ n'anwụ. O kwuru nke a na mbido ọgbakọ ndị omeiwu Imo steeti nwere n'Oguta. Ihedioha kwuru: ""Aga m akpọ ndị orụ nchekwa dị iche iche ka ha nyochaa ndị nile chịburu steeti a."" Ihedioha banyere ọchịchị dịka Gọvanọ Imo n'abalị 29, nke ọnwa Mee, afọ 2019 Onye ọbụla n'ime ha mere nrụrụaka ga-agbọ ihe o riri. Mana Okorocha site n'ọnụ Nzewuji gwara BBC na ihe dịrị Ihedioha ugbua bu ịgba mbọ ịhụ na ọ rụrụ orụ ya nke ọma dịka gọvanọ karịa ị na-agagharị na-akọtọ aha Okorocha. ""Uwa nile ma nke oma na o nwebeghi gọvanọ n'Imo steeti rụrụ ọrụ dịka anyị si rụọ. "" Okorocha onye kwuru na Ihedioha na-eme nke a iji kpasasị ndị mmadụ anya n'ihe o kwesịrị i mere ndị Imo,sịrị, ""Ihedioha kwesiri ịgbado anya mara ma ọ ga-arunwu ọkara ihe Okorocha rụrụ n'Imo steeti."" O kwukwara na ọ baghị uru izaghachi Ihedioha na-ebubo ọ na-ebo Okorocha, tụmadị nke ọ sịrị na Okorocha ahafeghị ya ọchịchị n'aka nke oma. ""Ihe ndị ahụ nile bụcha asị asị."" O siri ọnwụ na-ekwu Okorocha hafere Ihedioha ihe nile ga-adị ya mkpa n'ọrụ ya dịka gọvanọ. Akụkọ ga-amasị gị: Ndị Igbo na Naịjirịa: Ihe Abaribe kwuru maka ọnọdụ ndị Igbo na Naijirịa Abuja enyeghi m vootu mana aga m echekwa ha - Buhari" afirika-51354207,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354207,Rev Emmanuel Obimma kwuru na ọ ma na 'wayo' ga-abanye n'ikpe Hope Uzodinma,Rev. Fr. Emmanuel Obimma a ma dịka Ebube Mmụọnsọ kwuru obi ya maka ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya ugbua.,"Fada Obimma nke Holy Ghost Adoration Mịnịstrị dị n'Anambara steeti, kwuru na o cheghi na okwu gbasara IPOB gaara apụta ihe ma ọ bụrụ na ọnọdụ Naịjirịa dị mma. O kwukwara sị na ""anaghị ere amụma ere. Ọnụ ụkọchukwu na-ebu amụma"", ka a jụrụ ya ihe o chere banyere amụma Fada Ejike Mbaka buru n'isi Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti. N'etu ikpe ahụ si dapụta, Fada Obimma kwukwara sị na ọ ma na ""aghụghọ ga-abanye n'ime mkpebi ikpe ahụ"". Lee ihe nkiri a ka ị chọpụta ihe ndị ọzọ o kwuru. Ndị mere ihe nkiri a bụ Uche Akolisa na Chiemela Peter." afirika-49783313,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49783313,New Yam Festival: Etu Ikeji Arochukwu nke afo a si kpọtụ,Ndị Aro bi n'obodo dị iche iche bịara nara ike ha ga-eji rie ji ọhụrụ n'ebe ha bi.,"Ndị Asaga Arochukwu gị agụ bịa Amaikpe maka Eke-ekpe Ha gọrọ ọfọ, tee egwu, rie nri ma ñụọ mmanya maka afọ gara aga, ebe ha na-arịrọ chukwu maka afọ ọrụ ugbo ọhụrụ. Ndi ogo ọbụla na-ebupụta mmọnwụ ha. Ebe a ka ha na-arịọ chukwu ka ọ gọzie ha n'ụzọ ije ebe ọbụla ha nọ na-arụ ọrụ maọbụ azụ ahia. Ndị Aro bị n'ụzọ bịara were nzụ ha ji a lahachị azụ ebe ha bi. Lee ka o sị ga na foto Eze Aro na-awa ji Ji Ọhụrụ Iko e dowere ndị kacha gbaa egwu. Ndị gbara ndị nke mbụ ruo nke ise ga-ebu ya tinyekwara ego mmachị akpa so ya n'azụ. Iko maka okoko ndị kacha agba egwu. Egwu ụmụagbọnyọ bu bịa Eke-ekpe Egwu Ojojo bịara Amaikpe Onyeisi Nzukọ Aro n'uwa gbaa gburugburu bụ Mazi Geaorge Ezumah na Osote ya bụ Nwosu Nwaka Egwu ndị Amaoba bu bịa Eke-ekpe Obu ụzọegwu ndị Ibom Ada Mazi Nnenna na-egosi Aro nke o jiri bịa Ọgbọ Amaikpe juru eju na mmadụ Ndị Atani ji Enyi bu mmadụ bịa Ndị egwu Aba, Isimkpu ji akwa na iri uju bịa Amaikpe maka Eze Ogo ha nwụrụ anwụ igosi na obi adịghị ha mma. Nwamazi Nnameke Oti na ebunye ndi nwetere iko itiaka n'obi. Mazi Nkem Okoro na-ebunye ndị nke atọ iko ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-50186048,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50186048,Butt Implant: 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote',Sophie Elise bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ nwere agba n'ihe onyonyo na Norway ma nwee ndị nkwado puku narị ise n'elu 'Instagram'.,"Ụmụnwaanyị abụo ndị mba Ịngland nwụrụ mgbe ha gara ka a waa ha ike na mba Tọki Sophie kọwara na o nwere obere ahụ mana ọ chọro ka e wulite ukwu ya ka ọ dị ka nke 'nwaanyị Owere'. Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa iwulite otele dị ka ngwaahịa n'Instagram, Sophie graa mba Tọki ịzụta otele nke ya. O kwuru na ọ na-atụ anya na ọ ga-ada ezigbote ọnụ, mana ha beere ya ezigbo ego nke mere ka obi dị ya mma. O rụola afọ ise Sophie tinyere otele ukwu ọhụrụ ""O bere ego oo, o bere ego karịa ihe ọ kwesịrị ibụ"" ka Sophie gwara ndị mgbasa ozi 'Radio 1 Newsbeat' Gịnị mere ọ ji chọọ ịwepụ ya ugbua? O kwuru na mgbe a wachara ya otele, na ahụ fụrụ ya ụfụ. Mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ na Soshal Midịa bidoro kwuwe okwu maka otele ya. Ndị mmadụ kwuru na otele ọhụrụ ahụ na ahụ ya agakọghị nke ọma. ""Ugbua ka m matara na ọ bụghị ihe m kwesịrị ime. Ihe niile mere m 'vuum' n'anya, ugbua ka m matara na m echeghị ya ọfụma tupu m waa otele m"" ka Sophie kwuru. Sophie tinyere nke a na-etinye etinye akpọro 'Silicone' mana e nwere atụmatụ ọzọ ebe a ga-ewere abụba dị n'ahụ mmadụ were tinye n'otele ka o buo ibu. Ọ chọpụtala na ahụ ya mara mma ma ghọta na onweghị ihe o ji. Mana ịwepụ otele ya ugbua nwere 'Kọma' Sophie mechazịrị chọta onye dọkita na-awa ahụ nke ọma. Nkechi Blessing sunday: Otele ukwu m na-ekopu ụwa Dọkita a kọwaara ya na o nweghị ike ịwepụcha ha niile n'ihi na nke e tinyeere ya bụ nke a na-etinye n'ara. Ọ gwara Sophie na ihe ga-emebi ma e wepụchaa ha niile n'ike. Sophie kwuru na ọ ga-arụzi otele ya n'ọdịnihu, mana ka ọ dị ugbua, ọ ga-ewelata ya ka ọ dịkwa ka ihe yiri anụ ahụ mmadụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkịrị ga-amasị gị: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'" afirika-53304926,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53304926,Imo Pension Fraud: Lee ndị gọọmentị sị na-ezu ụgwọ ọnwa ezumike nka n'Imo Steeti,Gọomentị Imo Steetị ewepụtala aha mmadụ asatọ ha sị na-eri ụgwọ ọnwa ndị lara ezumike nka na steetị ahụ.,"Nke a dị n'ozi ha wepụtara n'akara Twitter n'ụbọchị ise nke ọnwa Julaị, 2020. End of Twitter post, 1 Gọọmentị Imo sị na mmadụ asatọ a riri ego dị nde narị naịra atọ na iri atọ na atọ N330m n'ime otu afọ. Lee aha ndị a na ego ole ha riri Ajokubi H. A nọ n'ogogo iri na ise na-eri ego dị (N5,473,790.92) kwa ọnwa, na-eri (N65,685,497.00) kwa afọ. Njoku Damian nọ n'ogogo iri na ise na-eri ego dị (N5,042,439.58) kwa ọnwa, na-eri (N60,509,275.00) kwa afọ. Obasi Canice nọ n'ogogo iri na isii na-eri ego dị (3,460,366.64) kwa ọnwa, na-eri (N41,524,399.60) kwa afọ. Anyanwụ, F. N n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N3,150,336.00) kwa ọnwa, na-eri (N37,804,032.00) kwa afọ. Emenalo, Theresa na-eri ego dị (N3,058,592,00) kwa ọnwa, na-eri (N36,703,010.00) kwa afọ. Joan Sunday nọ n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,320,624.00) kwa ọnwa, na-eri (N27,847,488.00) kwa afọ. Ajaegbo, E. O. n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,298,910.34) kwa ọnwa, na-eri (N27,586,924.10) kwa afọ. Ekedere, Eunice n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,707,501.33) kwa ọnwa, na-eri (N32,490,016.00) kwa afọ. Nyocha gọọmentị mere sị mmadụ karịrị otu puku larala ezumike nka kamgbe afọ 1976 ka na-anata ụgwọ ezumike nka rute ugbua. Ọzọ kwa bụ na onye ọkaipke lara ezumike nka na-eri ego puku narị atọ kwa ọnwa bụ nke karịrị ego o kwesịrị iri. Onye bụbu odeakwụkwọ gọọmentị nwụrụ anwụ ka na-eri ụgwọ ezumike nka rute ugbua. Nke a na-abịa dịka gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma ṅụrụ iyi na ọ ga-ewepụta aha ndị mere nrụrụaka n'ụgwọ ezumike nka. Cheta na ndị lara ezumike nka n'Imo Steetị mere ngagharịiwe maka akwụghị ha ụgwọ kamgbe gọvanọ Hope Uzodinma bara n'ọchịchị. Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Hope Uzodinma bụ Oguiwike Nwachukwu ichọpụta etu ha si mee nyocha a, ọ sị na ọ dịghị ya n'aka ịza ajụjụ a. N'otu aka a kpọkwara kọmishịọna mgbasaozi n'Imo State bụ Declan Emelumba Uzodimma mana ọ zaghị ekwentị ya. Mana mgbe a kpọrọ onyeisioche otu jikọtara ndị lara ezumike nka, ngalaba Imo Steetị bụ Josiah B. Ugochukwu, ọ sị na ọ hụbeghi aha ndị a gọọmentị wepụtara. Ugochukwu sị na ọ ga-etinye ọnụ n'okwu a mgbe ọ hụchara akwụkwọ ozi bu aha ndị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Etu e si wakpo ma gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti" afirika-49511086,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49511086,Xenophobia in South Africa: Gọọmenti etiti akpọọla onye nnọchiteanya ndị South Africa na Nigeria,Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara maka mmekọrịta ụmụ Naịjirịa na ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ga-ezute onye na-anọchite anya ndị South Afịrịka na Naịjiria bụ Bobby Moroe.,"Onyeama bara ezigbo mba maka mwakpo a ma na-ekwusi ike na Naịjirịa ga-eme ihe ik Nzụkọ ha ga-enwe metụtara mwakpo mere na mba South Afịrịka nso nso a kamgbe izu ụka gara aga. Cheta na Onyeama depụtara n'akara twitter ya na ozuola maka mwakpo Souh Afịrịka na-emeso ndị Naịjirịa bi na mba ahụ. Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu. Anya anyị ka dị na akụkọ a ,anyị ga-agba mbọ wetere gị ka o si aga dịka ọ na-eru anyị ntị. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na-abasị mba ike maka mwakpo ọhụrụ a mere na South Africa Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu amanyela ọnụ n'ọgbaghara ọhụrụ nke ịkpaoke agbụrụ na-eme na Saụt Afrịka. Onye dịka Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ndị Naịjirịa bi na mba ofesi depụtara ozi ọhụrụ n'akara twitter ya. O kwuru na ọ ga-adị mma ka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Naịjirịa kwee ka gọọmenti etiti nakwa ndị niile onye nke ha nwụrụ n'ọgbaghara ịkpaoke agbụrụ gaa n'ụlọikpe Africa na-ahụ maka nke ikike ruru onye. Onye zọburu oche onyeisiala na ntuliaka 2019 bụ Kingsley Moghalu kwuru na oge eruola mgbe Naịjirịa ga-eji kwụghachị ndị Saụt Afrịka ụgwọ maka agwa ịkpaoke agbụrụ ha na-akpaso ha. @AbangMercy na-rịọ ka ụmụ Naịjirịa kwụsị ị na-aga mba Saụt Afrịka maka ihe mere ya mgbe ọ gara ebe ahụ n'afọ 2013. @cbngov_akin1 na-akatọ okwu osote onyeisi ndị uweojii na Saụt Afrịka Ọtụtụ ndị ọzọ nọọkwa n'elu twitter na-ekwusi ike ka gọọmenti Naịjirịa ghara ịgba nkịtị maka ọgbaghara ọhụrụ ikpaoke agbụrụ megide ndị Naịjịrịa dapụtara na South Africa. South Africa Xenophobia: Ndị Naịjirịa bi na South Africa ekeela nkwụcha Ikechukwu Samson bụ onye Naịjirịa bi na mba Saụt Afrịka ekwuola na ihe ha ji anya ha ahụ na mba ahụ abụghị ihe ga-eme ka ha gbaa ọsọ. Samson gwara BBC Igbo na mwakpo ndị Saụt Afrịka na-eme rutere ndị mba ọzọ, mana ọ bụ ndị Naịjirịa ka ọ kacha metụta. O kwuru na ndị omekome a gara ebe ndị na-ere ihe dịka ụgbọala na ebe a na-arụzi ụgbọala, na-esunye ha ọkụ; o kwukwara na ha agbaala ihe karịrị ụgbọala 25 ọkụ. O kwuru na ha enweghi ike ịkọwa ihe bụ isi esemokwu a, mana ihe kacha ewute ha bụ ihe ndị mmadụ e mebichara. O kwukwara na o nweghi ike ịkọwa ma e nwere onye nwụrụ na mwakpo a, maka na ọtụtụ foto na ihe nkiri na-efegharị na soshal midia edochaghị anya mgbe o mere. Samson kwuru na ka o sila dị, na ha na-eke nkwụcha wee na-eze onwe ha na ezinaụlọ ha. Gọọmentị etiti etinyela ọnụ Minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ofesi bụ Geoffrey Onyeama sị na ha agaghi agba nkịtị na-ekiri ka a na-awakpo ndi Naịjiria bi na Sawụt Afịrịka. O kwuru nke a ka akukọ na-apụta maka mwakpo a na-eme ndị mbịarambịa na ya bụ mba. Onyeisiala Naịjirịa na ogbo ya nke Sawụt Afịrịka zutere na Japan mgbe e mere TICAD7 Maazị Onyeama sị na ike agwụla Naịjirịa etụ e si agba ụlọahịa na akụnaụba ndị Naịjirịa ọkụ dịka ndị uweojii adịghị echekwa ha etụ o si kwesi. N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, narị kwuru narị ndị mmadụ malitere mwakpo ndị mbịarambịa ma na-ezu akụnaụba ha nke ha agbaghị ọkụ. Ihe a mere n'ebe dị iche iche na obodo Johannesburg. Ụlọ ntaakụkọ a kpọrọ ""News Agency of Nigeria"" dere na mmadụ atọ nwụrụ n'ime mwakpo a. Ndị Naịjirịa 116 anwụọla site na mwakpo metụtara ihe Bekee kpọrọ 'Xenophobia' kemgbe afọ 2016 Ka ọ kwụ ugbua, ndị uweojii na Sawụt Afrịka anwụchịela mmadụ 43 ha sị na aka ha dị na ya bụ mkpa mkpa. Ndị uweojii gbara anwụrụ anya mmiri na mgbo egbe nke rọba nakwa akụrụmgwa ndị ọzọ iji wụọ mmiri oyi n'ọgbaghara a. Amabeghị onye malitere mkpa mkpa mana ụdịrị akụkọ a abụghị ihe nti anubeghi na Sawụt Afịrịka. Ihe onyonyo dị na Twitter gosiri igwe mmadụ na-achọ ndị mbịarambịa ha ga-ememina. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-43152839,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43152839,EFCC agbala Ihejirika ajụjụọnụ gbasara mmefụ njeri $2.1,"Akụkọ kwuru na EFCC gbara Ihejirika onye duru ndị agha naijria afọ anọ n'oge ọchịchị nke Goodluck Jonathan,ajụjụonu ihe ruru elekere asaa ụnyaahụ.","Ihejirika ji enyeghị ha ọsịsa ajụjụoọnụ a jụrụ ya Nke a na-abia ọnwa ole na ole onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na Ihejirika na ndị ọzọ arụturụ aka n' ebubo imefu ego amapụtara maka igo ngwaagha iji lụso Boko-Haram ọgụ. Dịka otu onye ọrụ EFCC akpọghị aha ya si kwa ụlọ ntaakụkọ Premium Times, ""A jụrụ ya ajụjụ ihe gbasara igo ngwa agha mgbe ọ bụ onye isi ndị agha."" Wilson Uwujaren bụ ọnụ na-ekwuru EFCC asaghị ajụjụ ajụrụ ya gbasara okwu a. Ihejirika kwuru na ya enweghị ọsịsa nye ajụjụ ndị ajụrụ ya, ma rịọ ndị na-agba ya ajụjụ ka ya rue ụlọ nwe ike iwepụta ọsisa ya n'uju. Ndị nyocha na-eche na Ihejirika ji aha ndị ezinaụlọ ya na ndị ọzọ were nara ọrụngo igo ngwaagha nke ndị agha Naijriria. E mechara hapụ ya ka ọ la ma gwa ya ka ọlaghachi taa bụ Thursday ụbọchị Nkwọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" egwuregwu-50664980,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50664980,Manchester United vs Tottenham: Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya,"Ndi Igbo na-ekwu na nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ ayọchie ya anya,","Mourinho Mana Ole Gunnar Solksjaer gwara Jose Mourinho n'abalị Wenezde na nke a abụghị oge niile. Ụmụ Manchester United ji ọkpụ goolu atọ a satara otu wee dulaa ndị otu Mourinho bụ Tottenham Hotspur. Nke a bụ nke mbụ a na-emeri Mourinho kamgbe ọ weghaara ọkwa onye nkuzi bọọlụ ndị Tottenham izu uka abụọ gara aga. Cheta na Mourinho bụbu onye nkuzi ndị Man Utd tupu a chụọ ya n'afọ gara aga were Solksjaer nọchie anya ya. Rashford nyere goolu abụọ Man Utd ji merie Rashford bụ onye nyetere goolu abụọ Man Utd ji merie n'asọmpi ahụ. N'aka nke ọzọ, Dele Ali nyeteere Tottenham otu mkpụrụ goolu ha ji gbaa aka ahịa. Mmeri a buliri Man Utd n'ọkwa ndị nke isii na tebulu 'English Premier League'. N'asọmpi ndị ọzọ, Chelse jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu wee merie Aston Villa. Tammy Abraham na Mason Mount bụ ndị nyere ha mmeri a. Chelsea nọzị n'ọkwa ndị nke anọ ugbua. Jamie Vardy na James Maddison nyere goolu abụọ ndị Leicester City ji merie Watford. Ebe Liverpool na agwọ ndị Everton ịba na Anfield. Asọmpi ha ka na-aga n'ihu ugbua mana Liverpool ji ọkpụ goolu a satara abụọ emeri. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Onye kwesiri isi nri n'ụlọ: Di ka ọ bụ nwunye?" afirika-51112184,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51112184,"Biafra at 50: 'Ọkwa onyeisiala kwesiri ndị Igbo, anyị agaghị arịọ ya n'arịrịọ'",Ichie Nduka Eya kwuru nke a na mkparịtaụka nke BBC Igbo kpokọbara maka ncheta afọ 50 kemgbe agha Biafra biri.,"O kwuru na ọ bụghị tigbo zogbuo ka a ga-eji nweta ihe ndị Igbo na-achọ. Cheta na Ichie Nduka bụ otu n'ime ụfodụ ndị lụrụ agha Biafra mgbe ọ dara n'afo 1967. Ọ kọwakwara na Igbo dị Naịjirịa mkpa nke mere na agaghị a gbahapụ ha n'ihe gbasara ọchịchị. N'ọnụ ya ""Igbo so na ụkwụ atọ Naịjirịa kwụ n'elu ya. Ewepu otu ụkwụ kedụ etu Naịjirịa ga-esi kwụrụ?"" Onye ọzọ so kwa na mkparịtaụka a bụ Chinedu Mbah onye kpokọbara otu Ndị Igbo United. Ọ sị na oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga abịakọta ọnụ jiri otu olu kwuo ihe ha chọrọ ma sowe ya. O kwuru na ndị Igbo sepụ aka n'ihe niile ga-ebute agha ọzọ. Ihe ndị pụtara na mkparịtaụka a n'aha ịchafụ 1. Anyị chọrọ onyeisiala Igbo dị mma na abụghị onyeisiala Igbo nkịtị"" 2. Ndị ahụghị ndị Igbo n'anya kpọrọ 'coup' mbụ 'Igbo coup' 3. Mmegbu ndị Igbo abụghị taa ka o bidoro 4. Iwu Hate speech bụ kaiji mechie Igbo ọnụ 5. Ndị e nyere 20 paunds ejirila ya merie ndị nyere ha 20 paunds. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'" afirika-45387226,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45387226,Ndịagha Naịjirịa agọọla na onweghị ndị otu ha Boko Haram gbụrụ,"Ndị agha Naịjirịa etinyela ọnụ n'akụkọ si n'ụlọ ntaakụkọ AFP pụta na ndị omekome Boko Haram wakporo ngige ndị agha n'obodo Zari, nke di n'okpuru ọchịchị Guzamali dị na Borno steet.","Maiduguri dị na Naịjirịa bụ ebe agha a kacha ada ụda Onye na-ekwuchiri ndị agha nọ n'atụmatụ ha ji ebuso Boko Haram agha bụ Lafiya Dole bụ Onyema Nwachukwu kwuru ọ bụ eziokwu na ndiagha na ndị Boko Haram kwara mgbọ, mana ọbụghị eziokwu na ndịagha ruru iri atọ nwụrụ. Nwachukwu kwuru na ọ bu ndị Boko Haram ka ndị agha gbụrụ na ya bụ akwam mgbọ. Okwu Nwachukwu bụ na akụkọ AFP, nke kwuru na ọtụtụ ndi Boko Haram ji ụgbọala wakporo ya bu ngige ndị agha wee nata ha ya nwantintin oge ka ha gbụru ndị agha iri atọ, akwụghị ọtọ. Nwachukwu sị na ha enwetebeghi ozị banyere ndị nwụru na ya bụ mwakpo, mana ọbụghị eziokwu na mmadu iri atọ nwụrụ'. Akụkọ a pụtara ka ndị Boko Haram na-eme ọtụtụ mwakpo na ngige ndị agha na Bornu, na-azụ ka ndi agha na gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na ha emeriela ndị Boko Haram na atụmatụ ha kpọrọ 'technicallly' n'asụsu Bekee. Nwachukwu kwukwara na akụkọ AFP ekwụghi ihe mere, dika na ọ bụ obodo Zari ka ndị omekome ahụ wakporo, nke mere ndị agha nọ na gbụrụgbụru ahụ jiri ga-ibuso ha ọgụ, ""Anyi gbụrụ ọtụtụ ndị Boko Haram, ma nata ha ngwa agha ha,' Nwachukwu kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49844980,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49844980,Nigeria vs P&ID: Naịjirịa anatala ikike ikpegharị ikpe ya na ụlọọrụ P&ID,Otu ọkaikpe na UK enyela Naịjirịa ikike ịgbagha ikpe e kpere nke sịrị ha kwụọ ụlọọrụ 'Process and Industrial Development' ego dị ijeri dọla itoolu na ụma isii.,"N'ikpe mbụ e kpere n'ọnwa Ọgọst sị na Naịjirịa ga-ahapụrụ ụlọọrụ a akụnaụba ndị ọnụ ego ya ruru ijeri dọla itoolu na ụma isii ($9.6bn). Mana n'ikpe nke a ọkaikpe na UK kpere n'ụbọchị Tọọzde 26 Ọgọst, 2019, ọ sị na Naịjirịa ga-agbanyụ ọkụ inye ụlọọrụ a akụnaụba ndị ahụ. Nke a nyere Naịjirịa ohere ikuru ume dịka ikpe a ga na-aga n'ihu n'etiti ha na ụlọọrụ P&ID. Ọkaikpe nyere iwu ka Naịjirịa kwụọ ụlọikpe a ego dị nde narị dọla abụọ ($200m) n'ime ụbọchị iri isii iji gbochie nkpachi akụnaụba ha. Cheta na Naịjirịa gara n'ụlọikpe dị na mba UK maka ime udo n'etiti ha na ụlọọrụ P&ID. Ndị so mee njem a gụnyere Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu. Anambra agọọla bọjet ha Anambra steeti esorola na ndị mbụ wepụtara usoro mkpata na mmefu akụ bụ bọjet nke afọ 2020. Willie Obiano bụ onye bupụtara bọjet a n'ihu ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ sị na otu ijeri narị naịra, iri atọ na asaa ka ha ga-etinye n'ọrụ n'ime afọ 2020. Gọọmentị sị na isiokwu bọjet ahụ bụ maka nkwado ndị ntorobịa nakwa ịrụzi ihe eji enyere ndụ aka na steeti ahụ. Ha sị na pesenti 43 bụ ijeri Naịra 58.69 ga-aba n'ụgwọ ọnwa nakwa ihe ndị ọzọ na-eme ka ọrụ na-aga werewere. Ebe pesenti 57 bụ ijeri 78.3 ga-aba n'ọrụ ihe eji enyere ndụ aka dịka okporoụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ihe ndị ọzọ. Obiano sị usoro mkpata na mmefu akụ a ga-enye aka ịkpọbata ndị oji ego achụ ego na steeti ahụ. Jacques Chirac a lala mmụọ Jacques Chirac bụ onye ihe gbasara Yuropian Unionu masịrị nke ukwuu. Onyeisiala mba France bụ Jacques Chirac alaala mmụọ mgbe ọ gbara afọ iri asatọ na isii. Ọgọ ya nwoke bụ Frederic Salat-Baroux gwara ndị ntaakụkọ na Chirac lara n'udo. Super Eagles na Brazil N'egwuregwu, Super Eagles nke Naịjirịa ahọpụtala ndị ga-eso sọọ mpi enyi na enyi ha na mba Brazil n'ụbọchị 13 Ọktoba, 2019. Onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr kpọrọ ha Alex Iwobi, William Troost Ekong na Samuel Chukwueze. Ndị ọzọ gụnyere Wilfred Ndidi na aha mmadụ iri abụọ ndị ọzọ ga-esọ ya bụ mpi na Singapọre. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52819560,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52819560,Sexual Assault: A chụola okaikpe n'ọrụ maka ịsị nwaanyị 'mechie ụkwụ gị',A chụola okaikpe n'ọrụ maka isi nwaanyị 'mechie ụkwụ gị' n'okwu mwakpo n'ike.,"A chụola okaikpe n'ọrụ maka isi nwaanyị 'mechie ụkwụ gị' Dịka ụlọakụkọ Associated Press si dee, ụlọikpe kachasị na New Jersey dị na mba Amerịka chụrụ ọkaikpe John Russo n'ọrụ ọkaikpe maka na ọ gwara nwaanyị a wakporo n'ike na ọ kara 'imechi ụkwụ"" ya maọbụ kpọọ ndị uweojii ka a bịara ịwakpo ya. Onyeisi ọkaiwu bụ Stuart Rabner kwuru na okwu ahụ kwuru gosiri na o kweghị ekwesị ịhapụ ya ka ọ na-ekpe ikpe gbasara mkpagbu edị na ezinaụlọ maọbụ iwakpo. Otu nwaanyị a kpọghị aha ya wetaburu mkpesa n'ụlọikpe Russo n'afọ 2016 ebe ọ rịọrọ ka ụlọikpe ya nye nwoke wakporo ya iwu ya abịakwala ya nso ọzọ. Otu ndị ọkaikpe mmadụ atọ a họpụtaburu ka ha lebanye anya n'ihe Russo mere tụnyeburu alo ka e wepụ ya n'oche ndị ọkaikpe. Russo, onye rọburu gbaghara maka okwu ya sị na ọ bụ ọchi ka ya na-akpa. Ọ sị na ntaramahụhụ e nyere ya karịrị akarị dịka otu e hibeburu nyeburu ntuziaka ka a kwụsị ya ọrụ n'ike na-akwụghị ya ụgwọọnwa ọnwa atọ. Ndị Amaọbịa na Umuerum enwetala eze ọhụrụ Igwe Chinyelụ Nwora Molokwu bụ Eze ndị Amaọbịa, ebe Igwe Christopher Ndibe bụ Igwe ndị Umuerum Ndị obodo Amaọbịa na Umuerum dị n'Anambra steeti enwetala eze ọhụrụ. 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze' Igwe Chinyelụ Nwora Molokwu bụ Eze ndị Amọbịa, ebe Igwe Christopher Ndibe bụ Igwe ndị Umuerum. Molokwu meriri mmadụ anọ ndị ọzọ ya na ya zọrọ ọkwa eze n'afọ 2019 bụ ndị si n'Ụmụeze bụ ebe ndị Amaọbịa nyere ntuziaka ka a họpụta ndị ga-azọ ọkwa eze. O ji vootu narị abụọ na iri anọ na anọ merie onye sochiri ya n'azụ bụ Ichie Eddy Nwokoye. Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ n'obi gọọmenti dị n'Ọka nye ha asambodo dịka onye eze na nso nso a.. Ndị nọ ebe nke a mere gụnyere onyeisi ụlọomeiwu Anambra steeti nakwa onyeisi ndị Eze n'Anambara steeti bụ Igwe Nnaemeka Achebe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45544735,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45544735,Akachapụọla 'osu' n'obodo Ozalla,"Anya mmiri juru ndị gbakọrọ anya, ọṅụ eju ha obi ebe ha jịkọrọ aka kachapụ omenala ịkpaoke agbụrụ osu tinyere nkewa n'etiti ha na ụmụnwanne ha.","Ụlọụka dị icheiche pụtara ị kwado ya bụ mmemme Otu kpọkọbara emume a bụ ngalaba akpọrọ PASO n'ịchafụ (PASO n'ahụ maka nkachapụ ihe ọbụla ga-ebute nkewa n'Ozalla) nakwa otu jịkọtara ụka Krịast n'Enugwu bụ CAN nakwa ndị na-achị obodo ahụ. Onyeisi otu na-ahụ maka Oganiru Ozalla bụ Afam Ani kwuru etu obi si dị ya ụtọ, o kwuru na udo na ịdị n'otu dị mkpa maka na ụlọ kewara abụọ agaghị abara onwe ya uru. N'okwu ya ""Obi dị m ụtọ n'ihe a mere, o gosiri na udo alaghachitela ebe anyị nọ"". Reverend Joseph Ajujungwa, bụ onye odeakwụkwọ CAN n'Enugwu, gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ Chineke kere mmadụ niile, na nkewa adịghị n'etiti osu na dịala n'iohu ya. Ajujungwa sị: ""mmadụ niile rikọrọ nrị, ṅụọ mmanya ma tee egwu iji gosi na ha bụ otu"". N'agbanyeghị na mmiri na-ezo n'ụbọchị ahụ igwe mmadụ si n'obodo ahụ pụtara ịkwado ya bụ emume e mere n'ọgbọ ụlọụka St. Pauls dị na 4 corners, Ozalla. Ihe mere n'ụbọchị ahụ Mmadụ niile n'obodo Ozalla gara n'ebe bụ obi ala ha, ndị okenye n'obodo were tinye iwu na onweghịzi onye bụ osu n'ime ha. Na ụbọchị sọ ya, ndị ụka dị icheiche gara gozie ndị obodo ahụ iji gosi na ha kwadoro emume ha mere tupu mmadụ niile e rịkọ nri ọnụ. Kedu onye a na-akpọ osu? BBC Igbo gbara otu nwoke bụ Emmanuel Ihenacho ajụjụ gbasara ya, o kwuru sị ""mgbe gboo, a na-achapụ onye bụ osu otu ntị ya, ka ndị mmadụ ji mara ya"". ""Ihe ọzọ bụ na a na-ekenye ha ala n'isi ọdọahịa. A ka na-eme nke a ruo ugbua"". ""Osu adịghịzị ugbua etu ọ dị na mbụ"". N'agbanyeghi na e tiri iwu iji kwụsị osu n'ala Igbo kamgbe afọ 1956, ụfọdụ ndị ka na-emegide ndị a na-ahụta dịka 'osu'. Ọtụtụ oge ka a na-anapụ ha ikike ha nwere dịka mmadụ. Etu e si emegide osu n'ala Igbo" afirika-49081767,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49081767,Tanko Mohammed: E duola ọkaịkpe kachasị ọhụrụ n'iyi ọrụ,Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola Tanko Mohammed n'iyi ọrụ dịka okaikpe kachasị na Naịjirịa taa n'Abuja.,"Tanko Mohammed ga-anọchi anya Walter Onnoghen bụbu onye nọ n'ọkwa ahụ. Cheta na akwụsịtụrụ Onnoghen ọrụ ya maka ebubo mkpachi akụnaụba ya. Gịnị na-afịọ n'Enugwu? Ndị mmadụ bi n'Enugwu na-ata ikikirieze tata bụ Wenezde dịka otu jikọrọ ndị na-ere ma na-ekesa mmanụ ụgbọala gbachiri ọdọ ahịa dị iche iche n'ihi nsogbu dị n'etiti ha. N'Egwuregwu, Aka na-achịkọta otu Manchester United bụ Ole Gunner Solskajaer arịọla arịrọ ka ndị nso Club ahụ akpọrọ Red Devils na Bekee nabata Paul Pogba ma mee ka obi ruo ya ala n'otu ha dịka ọ na-akwado ibido afọ ọhụrụ na Premier Lig. US Visa: Inweta akwụkwọ njem ga-esiri ndị kpara agwa megide ntuliaka 2019 ike Ndị pati ndọrọndọrọ ọchịchị APC na PDP azachiela embasi Amerika okwu ha kwuru maka ịkpachapụ ndị mere nrụrụaka ndọrọndọro ọchịchị akwụkwọ ikike ị ba ala ha. Odeakwụkwọ mgbasa ozi PDP bụ Kola Ologbondiyan kwuru na egwu anaghị atụ ha bụ PDP maka okwu a, makana aka ha dị ọcha, na ọbụghị ha nọ n'isi ọchịchị Naịjirịa. O sị na ọ bụ ndị pati nọ n'isiọchịchị kwesiri ịtụ egwu. N'aka ọzọ, onye nke APC bụ Lanre Issa Onilu zara na ya agụbeghị ya bụ akwụkwọ embasi US biputere. Ọ sị na ""ọ bụ ahụ okwu, ahụ ọsịsa ya"". Lanre kwukwara na ebe ọ bụ na ya bụ ụlọọrụ nnọchite anya mba Amerika na Naịjirịa emetubeghị onye ha na-agwa aka, ọ baghị uru ịzahachi ha. Ọ sị na ""ugbua ka bụ ụtụtụ"". Cheta na-ịnweta akwụkwọ njem ịga Amerịka ga na-esiziri ndị kpara agwa megide ntuliaka 2019 ike dịka mba ahụ wepụtara ha anya ọbaraọbara. Ọnụ na-ekwuru Odeakwụkwọ Amerịka bụ Morgan Ortagus bụ onye kwupụtara nke a n' igwe okwu Twitter ya. Ortagus kwuru na nke a bụ ụzọ mba ahụ si egosi na ha kwụsịrị ike na inyere Onyeisiala Muhammadu Buhari aka ikwalite ọchịchị onyekwuoucheya. Mana ha edepụtaghị aha ndị mmachiị ọhụrụ a metụtara. Ụgbọelu Air Peace efefeela ebe o kwesịrị ifetu na Legọs Ihe mmapụ obi mere n'ụbọchị Tuzde, Julaị 23, 2019, dịka otu ụgbọelu ndị Air Peace si Pọtakọt fefere ebe ọ kwesịrị ịkwụsị ka ọ na-efetu n'ọdọụgbọelu nke Legọs. Henrieta Yakubu nke ngalaba na-ahụ maka ụgbọelu bụ 'Federal Airport Authority of Nigeria' (FAAN), gwara BBC na ha na-eme nyocha ịmata ihe butere ya. Dịka Yakubu gwara BBC Pidgin, ọ sị na ngalaba Accident Investigation Bureau (AIB) na-enyocha ihe mere. O kwuru sị, ""Biko ọ bụ obere mmafe ka ụgbọelu ahụ mafere, ọ kpọkasịghị. Ndị njem nọ n'ime ya emerụghị ahụ. ""Ka ọ dị ugbua, AIB nọ ebe ihe a mere na-enyocha ya. Achọghị m ikwu ihe ọbụla ruo mgbe ha mechara. Mana ụgbọelu ahụ akpọkasịghị."" Cheta na ụgbọelu Air Peace ọzọ nwetara onwe ya n'ime ọhịa n'ime ọnwa Juun 2019. Nke a na-abịa ka otu afọ ihe ụdịrị ihe a mechara, gafere. Gụọ maka ya ebe a Ọ fọrọ nwa ntịị ka ọdachi mee n'ụgbọelu Air Peace? Gịnị ka ị ma maka #MinisterialList ọhụrụ Buhari wepụtara? N'ime aha mmadụ iri anọ na atọ Buhari wepụtara, naanị mmadụ asaa bụ ụmụnwaanyị, ebe o nweghị onye pekarịrị afọ iri anọ na ise n'ime ha. Ụfọdụ ndị mmadụ akatọọla aha ndị mịnịsta ọhụrụ e wepụtara sị na ọ bụghị ihe a tụrụ anya ka a hụrụ dịka ụmụnwaanyị na ndị na-eto eto anọghị na ya dịka o kwesịrị. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ministerial list: Ụmụ Naijiria akatọọla ndị mịnịsta ọhụrụ Boris Johnson bụ Praịm Mịnịsta ọhụrụ Briten A họpụtala Boris Johnson dịka Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Briten. Johnson, onye ji ihe ruru vootu puku iri anọ na isii merie Jeremy Hunt, ga-anọchi Theresa May rituru n'ọnwa gara aga. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Boris Johnson abụrụla Praịm Mịnịsta Briten N'egwuregwu, Egwuregwu a wetara ""pre season"" bụ egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke Chelsea n'isi njedebe Chelsea gwọrọ Barcelona ara ka ha ji goolu abụọ a sara otu n'ọgwụgwụ oge ji merie ha ma bulie Iko Rakuten. Chelsea ji nke a weta egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke a kpọrọ ""pre-season"" n'isi njedebe. Gụọ etu o si mee ka o ju gị afọ ebe a: Chelsea akọọla Barcelona ka ncha nkọta Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe mere e ji kutuo igwe Rochas ji chọọ Owere mma Ihe BBC hụrụ n'Owerre bụ na akutuola igwe ndị Okorocha jiri chọ Imo steeti mma mgbe ọ nọ n'ọchịchị. Steve Osuji gwara BBC Igbo na ọ bụ iji chekwa ndị mmadụ ka eji nye iwu ịkwatu ya bụ igwe. N'ọnụ ya ""Igwe ndị ahụ esighizi ike, o nwere nke dara n'ime ya dagide ụgbọala"" O kwuru na ọ bụ ka ọ ghara ịmerụ ndị mmadụ ahụ ka eji ewetu ya. N'otu aka ahụ, Emeka Ihedioha na onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari enweela nzụkọ imeụlọ gbasara Imo steeti. Dịka Ihedioha siri kwuo, okwu ndị ewelitere gụnyere ịkwalite ọrụ ugbo, agụmakwụkwọ, ahụike nakwa iwulite ngalaba dị icheiche na steeti ahụ. ""Ndụ mmadụ nkịtị adịghị ndị ọchịchị mkpa"" Ụmụ Naịjirịa na-egosi iwe ha na soshal midia maka ọnwụ Precious Owolabi bụ onye ntaakụkọ Channels. Owolabi nwụrụ dịka ọ na-arụ ọrụ isete ebe ndị uweojii na ndị shiites na-akwata ya na Abuja. N'akụkọ ofesi, Mba Sawụt Koria ekwetala na ọ bụ ha gbara ụgbọ agha nke mba Rọshịa mgbọ mgbe ọ batara na mbara igwe mba ha. Ha kwuru na ọ bụ maka na ọ dara iwu mbaraigwe mba Sawụt Koria. N'egwuregwu, Ọ bụ egwu ọṅụ na-akpọtụ ugbua n'Akwa Ibom dịka otu Akwa starlets ritere mbuli elu ruo na NPF league dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu merie otu Shooting stars. Ihe nkiri a ga-amasị gị: Ehi ga-eberịrị 'moo' tupu e ree ya n'ahịa anyị" afirika-44343243,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44343243,Akụkọ kachasị n'abalị a: Boko Haram egbuola ndị mmadụ na Zamfara,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n' abalị a : Boko Haram egbuola mmadụ iri na ise na Zamfara,"Ndị obu egbe a na-eche na ha bụ Boko Haram mmadụ iri na ise n'obodo Zakuna dị na Zamfara Steeti. Onye na-ekwucite ọnụ ndị uweojii na steeti ahụ Muhammad Shehu kwuru na ndị wakporo Zakuna n'isi ụtụ ụnyaahụ. Aka akparala nwoke gburu nwa ya nwaanyị Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị ahụ kugburu nne di ya Aka akparala otu nwoke akpọrọ Cletus Aguluka, gbara afọ iri isii n'obodo Awgbu dị n'Orumba North nke Anambra Steeti. Nwoke a bụ onye ji mma magbuo nwa ya nwaanyị bụ Onyinye Aguluka dịka ọ na-ehi ụra. Ndị uweoji kwuru na nyocha ka na-aga n'ihu ugbu. Akụkọ mba ofesi E duola onyeisiala mba Ejipt n'iyi ọrụ N'aka nke ọzọ eduola Abdel Fattah al-Sisi n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Egypt nke ugboro abụọ dịka ọn̄ụrụ iyi ikpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu. N'ọzọ; Ọrịa ebola ka na amụba na mba Kongo dịka Mịnịstry ahụike ha ekwuola na-enwela mmadụ ise ọhụrụ ometụtara na mpaghara ugwu nke mba ahụ Cheta na ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise anwụọla site n'ọrịa kamgbe ọ malitere nke ugbu abụọ. N'egwuregwu, Carl Ikeme ritere ihe akpọrọ 'ọkacha agba n'egwuregwu' mgbe Naịjirịa malitere njem iko mba ụwa Onye na-agbara Super Eagles bọọlụ bụ Moses Simon na ogbo ya na-echeche bụ Carl Ikeme ekwupụtala nwute dịka ndị na agaghị e so n'asọmpi iko mba ụwa. Ha gaara n'ihu kele ndị nkwado ha make ịhunnaya e gosiri ha n'ute ọrịa ha dị iche iche. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu" afirika-44657920,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44657920,Ọ pụtara na ndị na-anya tanka mmanụ karịrị gọọmentị?,"Ndị mmadụ ka na-agụkọ ihe ha tufuru n'ihe mberede okporoụzọ mere ụbọchị Tọọsde, abalị 29 nke ọnwa Juun, afọ a, ebe mmadụ itoolu tufuru ndụ ha n'ọkụ ọgbụgba.","Ọkụ si n'ụgbọala mmanụ gbagburu mmadụ itoolu ma mebie ọtụtụ ụgbọala N'ihe mberede ahụ, ụgbọala 54 gbara ọkụ ka ụgbọala mmanụ kwopụrụ n'ike daa ma nwuru ọkụ n'okporoụzọ. Ọ bụghị sọ na Legọs, ụgbọala mmanụ ataala isi ọtụtụ mmadụ na Naijiria ọkachasị n'obodo mepere emepe n'ihi amaghị eme nke ndị na-akwọ ya. Ndị na-akwọ ụgbọala mmanụ na nnukwu ụgbọala yiri ya na-eme ka mmawụ na-eti onwe ha, dịka ọtụtụ n'ime ha anaghị erube isi n'iwu gbasara njem okporoụzọ. Na Legos, enwere iwu gọọmentị mara n'oge ọchịchị Babatunde Fashola, nke kwuru ka ndị ụgbọmmanụ na ụgbọala gwongworo na-aga n'okporoụzọ naanị n'abalị. Onye Kọmishọna mgbasa ozi dị n'aka ya na Legọs steeti bụ Kehinde Bamigbetan, gwara BBC na ndị na-akwọ ụgbọala mmanụ na ndị nwe ya na-eme ka ha akarịrị iwu ala anyị. Ọtụtụ ndị mmadụ kwuputara etu ha si gbanarị ọkụ a na soshal midia O kwuru na mmachi nke gọọmenti steeti a n'oge Fashola machiri ụgbọala mmanụ ịga n'ehihie enweghị iwu kwadoro ya, nke mere na gọọmenti agaghị akpụpụli onye dara ya ụlọikpe. Bamigbetan kwuru na mbọ gọọmenti steeti a gbara iso iwu ahụ n'ọkụ butere ọgbaghara dịka ọ kọwara na otu ọkwọ ụgbọala gburu onye ọrụ ngalaba steeti na-ahụ maka ịhazi njem okporoụzọ nke a kpọrọ 'Lagos State Traffic Management Agency (LASTMA), na bekee, okwu ikpe ya ka dị n'ụlọikpe. Mgbapụ na nsogbu a dị Gọọmenti etiti n'aka Bamigbetan kwuru n'ihe ga-egbo ọgụ a bụ ""Gọọmenti etiti na ndị ọkwọ ụgbọala mmanụ na ndị nwe ya itinye ụkwụ n'otu traụza n'ihi ha na-agwakarị anyị na ha anọghị okporoụzọ nke Legos steeti."" Ọ gara n'ihu kwuo na ikike okporoụzọ awara awara dị gọọmenti etiti na ngalaba nhazi njem Federal Road Safety Corps (FRSC) n'aka, ịhụ na ndị ọkwọ ụgbọmmanụ natara ọzụzụ na akwụkwọ zuru ezu maka ịkwọ ụgbọala nakwa nyocha ịhụ na isi zuru ha oke. Ebe ọkụ ụgbọala mmanụ gbara Anyị ga-akpụpụ onye ọkwọ ụgbọala ụlọikpe-FRSC Onyeisi ngalaba gọọmenti etiti na-achịkọta nchekwa njem ụgbọala nke a kpọrọ Federal Road Safety Corp (FRSC) na bekee bụ Hyginus Omeje, kwuru na gọọmenti ga-akpụpụ ụlọọrụ nwe ụgbọmmanụ ahụ nwuru ọkụ ji gbagbuo mmadụ itoolu ụlọikpe. ""Anyị ga-akpụpụ ha ụlọikpe."" Ihe mere dị anyị obi mwute-Nupeng N'aka nke ọzọ, otu jikọrọ ndị ọrụ mmanụ nke a kpọrọ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas workers (NUPENG) na bekee kwuru na ọdachi ahụ dị ha obi mwute. Onyeisi NUPENG n'ọdịda-anyanwụ bụ Tayo Aboyeji, gwara BBC na ha kwara arịrị maka ihe mberede ahụ ma soro ezi na n'ụlọ ndị ometụtara n'iru uju. ""Otu ndị na-akwọ ụgbọmmanụ (Tanker Association Union) na ndị NUPENG na-ata onwe anyị ụta maka ihe a mere nke mebiri ihe otu a. Anyị na eti ezinaụlọ ndị ihe a metụtara aka n'obi."" O kwuru na ha na ndị ọrụ FRSC na-akparịta maka nchekwa ndị njem ma tụọ arịrị na ndị agboro na-achọ ịnapụta ndị otu ha na-eme njem abalị ego, so ebute ọdachi okporoụzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-54163350,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54163350,Aloy Ejimako: 'Akwụkwọ gosiri ndị Ipob e gburu n'Emene bụ eziokwu',Ndị ọrụ Orthopaedic Hospital Enugwu ekwuola na enweghị onye ọbụla nọ n'ọnọdụ gbata gbata ekedoro n'elu bed.,"BBC gara njem na ya bụ ụlọọgwụ iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu na ndị uweojii kedoro otu nwa ikorobia a na enyo enyo na ọ bụ onye IPOB. Nke a na-bia dịka ozi na efegharị na soshal midia kwuru na ya bụ nwata nwoke bụ Augustine Ani bụ otu na ndị agbara egbe n'ụbọchị August 23 oge ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uweojii, DSS na IPOB n'Emene Enugwu. Ọkaiwu Ipob nabatara aha ndị ekwuru nwụrụ n'Emene ewepụtara ọhụrụ a Ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimako sị na o kwenyere n'akwụkwọ otu a kpọrọ 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' wepụtara maka ndị Ipob nwụrụ n'Emene. Ọ sị na otu a bụ otu a ma ama dịka ndị na-eme nyocha nke ọma tupu ha a pụta kwuo maọbụ dee ihe ọbụla. Ejimako sị na ọ na-atara ozi ahụ n'akara e-mail ma leba ya anya, na ihe niile ha dere bụ eziokwu kama na o zuchabeghi ezu. Ọ sị na o kwenyere na ya ma kpọọ oku ka ndị Igbo na Naịjirịa niile kwenyere n'akwụkwọ a. Ọ gara n'ihu katọọ ogbugbu ụmụafọ Igbo n'Emene ma kwuo na ndị aka ha dị na ya ga-ata ahụhụ mgbe oge ruru. Otu a kpọrọ 'Intersociety' na-ahụ maka ikike dịrị onye wepụtara akwụkwọ ozi bu aha gụnyere aha ndị ha sị na e gburu, a nwuchiri nakwa a na-achọ achọ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na ndị Ipob n'Emene, Enugwu Steetị. Akwụkwọ ha a gosiri aha mmadụ isii e gburu egbu nakwa ndị ọzọ ha sịrị na a nwuchiri na ndị na-efu efu. BBC Igbo ka na-agba mbọ ị chọpụta ihe ndị uweojii nwere ikwu maka aha ndị a. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" 45570482,https://www.bbc.com/igbo/45570482,Akụkọ dị mkpa taa: Iwu bụ na ị ga-eji 'ID card' nke Naịjirịa bido na 2019,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ị ga-ejirirị 'ID card' gị,"Ngalaba na-ahụ maka njirimara na Naịjirịa bụ National Identity Management Commission (NIMC), ekwuola na onye ọbụla ga-amalite iji akwụkwọ njirimara ya bido n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2019, site n'iwu gọọmentị etiti nyere. End of Twitter post, 1 Iwu a na-ekwu na a ga na-eji akwụkwọ a eme ihe gbasara azụmahịa ụlọakụ, ndebanyeaha maka ịnata akwụkwọ ikike njem, akwụkwọ mkpuchi ahụike nakwa ịnata akwụkwọ e ji akwọ ụgbọala. ADF ga-akwado 'restructuring' Ndịgbo bị na Chicago, US Ndigbo bi na mba Amerịka ekpebiela ikwado mkpebi ndigbo e mere n'ọgbakọ Enugu nakwa nke Anambra. Ha kwuru na ha kwenyere na ala Igbo ga-akwụnwuru onwe ha ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị ekweghị ka a hazigharịa obodo Naịjirịa dịka o kwesịrị. Na mba ofesi, Mmiri ebufuola mmadụ abụọ isi na-ezuchaghi oke n'obodo Saụt Karolaịna dị na mba Amerịka. Ndị uweojii kwuru na ọnwụ mmadụ abụọ ahụ nwụrụ n'ime ụgbọala ndị bulitere ọnụọgụgụ ndị oke idemmiri a gburu n'obodo ahụ ruo iri atọ na asaa. Mgbe a ga-ebido ịgba asọmpi Champions League nke abalị a, Man City na Lyon ga-ezute, ebe Real Madrid na Roma ga-ama mbe n'abọ nke bụ oke n'etiti ha. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'egwuregwu, N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Enyimba nke Aba na otu Rayon nke Rwanda ga-akwata isi n'isi n'Aba taa n'agba anọ nke ikpeazụ asọmpi iko CAF Confederation afọ 2018. Enyimba lọtara ka ha na ndị Rayon gbara onwe ha onye laba onye laba mana ha bụ enyi kwenyesiri ike na ha ga-ememina ndị Rwanda taa. Ọ bụrụla ihe ịgba anya mmiri ihe idemmiri na-eme na steeti dị icheiche ọkachasị Anambara steeti na ebe ndị ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Akụkọ kwuru n'oke idemmiri emiela ụlọakwụkwọ mahadum nke Federal Polytechnic dị n'Atanị, n'okpuru ochichi Ogbaru na steeti ahụ. Naịjirịa Mana gọọmenti etiti ebela akwa arịrị banyere ya bụ nsogbu ebe onyeisiala Muhammadu Buhari kpọrọ ya ọdachi megide ala niile. Ndị ụlọọrụ NEMA kwuru na idemmiri a ga-emetụta ime obodo 14 n'Anambara steeti Buhari nyere iwu ka ngalaba gọọmenti niile were ikike ha na ihe niile ha nwere nyere ndị ọdachi a metụtara na stetti niile dị na Naịjirịa aka. Ọ sị n'ụfọdụ ndị sineti na ndị nchekwa so kpa nkata izu ọfọ n'imeụlọ sineti. Akụkọ mba ofesi N'ofesi, Nọt Koriya ekwetala imechi otu n'ime ebe kachasị ọ na-emepụta ma na-anwale ngwọagha nuklia na mba ha dịka onyeisi mba Saụt Koriya si kwuo. Nke a na-abịa ka ndị isi mba abụọ ahụ zutere n'ọgbakọ na Pyongyang ma kwekọrịta etu ha ga-esi wezuga ngwọagha nuklia ha nwere. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ị ma na akwamozu otu onye nwere ike ị bụ 'nke mmadụ niile'" afirika-54509763,https://www.bbc.com/igbo/afirika-54509763,Kwụsị ihe ndị a na-egbu 'Sperm' gị,"Igbo sị na ọ bụru na agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, e were ya kee nkụ.","Igbo kwenyere na otu ihe e ji a mara nwoke bụ ị nwe ike ịtụwa nwaanyi ime. Nke a mere na ọtụtụ na-eme ihe niile iji hụ na ha lụrụ nwanyị ma mụọ nwa. Kama e nwere ọtụtụ ihe ụmụnwoke na-eme na-ebute spam ha ịgba ọnyụpa n'ime ihe o kwesiri ịme. Gịnị bụ Uze? Uze nwoke Uze bụ seelu sị n'ahụ nwoke nke nwereike ịtụwa nwaanyị ime. Ọ bụ n'akpa amụ ka a ahụ nwoke si emepụta ya. Ọ bụ mkpụrụamụ nke bụ Testes na bekee na-emepụta uze. Dịka e si gosi n'ihe onyonyio ndị BBC wepụtara, uze na-abanye n'ahụ nwaanyị mgbe ya na nwoke nwere mmekọ na-eru narị nde abụọ na iri ise. Kama dịka etu aru nwaanyị si arụ ọrụ, ọ bụ nanị ihe dịka iri abụọ na-erute ebe akwa nwaanyị nọ. Lee ihe ụmụ nwoke na-eme na ebute ọnwụ maọbụ ịgba ọnyụpa spam ha. BBC Igbo na Dọkịnta bụ okaibe n'ihe gbasara nwoke ịtụwa nwaanyị ime bụ Uche Nwagha ebe ọ gwara anyị ụfọdụ ihe ụmunwoke na-eme na amaghị na ọ na-egbu uze ha. Ịṅụ sịga ṅụfee ya oke. Oke sịga adịghị mma maka uze nwoke Dokịnta Uche Nwagha kwuru na ịnụ sịga ṅụfee ya oke na-ebute ka ọnụ ọgụgụ uze ha pee mpe. Akụkọ a anaghị akọwa na ịnụ sịga na-egbu spam nwoke, kama ịṅụfee sịga oke, nwereike imetụta ọ dịmma uze gị. N'aka nke ọzọ, nyocha ndị mahadum nke Sheffield na mahadum Manchester mere nnyocha ma nke a ọ bụ eziokwu. Ha kwuru na o nweghi ihe siri ike gosiri na ịnụ siga na-ebute ogbugbu spam, kama dọkịnta Allan Pacey kwuru sị, ""Na-agbanyeghị nyocha anyị, ọ dị mkpa ka ụmụnwoke soro ndụmodụ ndị ọrụ ahụike ma hapu ịṅụfe Sịga oke"". Ọbante nke emepụtara na naịlọn wee dụọ maọbu ọbante jisiri akpa amụ ike Ịba eji Nylon mee Dọkinta Nwagha kọwara na ụmụ nwoke iyi ịba eji nylon mee maọbụ nke kechisiri akpa amụ ike adịghị mma. O kwuru na akpa amụ bụ ụlọ mkpụru amụ ebe na-emepụta spam ekwesịghị ị dị ọkụ. Ekpe m ọkụ na spam adịghị na mma ma ncha. Ịnya ụgbọala maọbụ gwongworo nke ijin ya dị n'okpuru oche ọkwọụgbọala Ndị na-anya ụgbọala injin ya nọ n'okpuru oche ya na-enwe nsogbu uze. Dkt. Uche Nwagha kọwara na ndị na-anya ụgbọala dịka bọsụ na gwongworo na-enwekarị nsogbu uze (sperm) adịghị ike maọbụ ezughị ezu. Ọ kọwara na nke a bụ maka na oche ha na anọ karị n'elu ịnjin ụgbọala maọbụ didebe ya nso. Nwagha kọwara na ọkụ si na ijin ụgbọala a na uze anaghị adị na mma. Nke a mere na mgbe ha nyara ya bụ ụgbọala gaa oglogo njem, ọ na-ebute nwoke adịghị ike ịtụwa nwaanyị ime. Ebe mmadụ na-arụ ọrụ Ụfọdụ ebe mmadụ na-arụ na ebute nsogbu uze. Dọkịnta Uche Nwagha kwukwara na ndị na-arụ ọrụ na ebe a na-arụputa Aluminim, Asbestos maọbụ ebe a na-ere ikuku gasị na-enwekarị nsogbu uze adịghiike ịtụwa nwaanyị ime. O kwuru na gbe ihge ndịa banyere ha n'ahụ, ọ na ebute ọnọdụ nke na-emetụta uze nwoke. Ụfọdụ ọgwụ ụmụnwoke na-aṅụ Dkt Nwagha kọwara n'ụfọdụ ọgwụ dịka 'anti-fungal' na-ebelata ọnụ ọgụgụ ma ike uze nwoke. O kwuru na ọ bụ nke a na-aṅụ aṅụ na-ebute nsogbu a. Nsogbu ụwa Mmadụ ezughị ike so ebute ọdachi uze Mmadụ enweghị ezumike zuru oke nke na-ebutere mmadụ ike ọgwụgwọ na ezughị oke nke bụ stress na bekee. Nwagha kọwara na homonu akpọrọ Luteinising hormone na bekee na-emepụta uze Tetestorone nke na-emepụta uze nwoke. A na-emepụta homonu Lutenising, homonu a bụ n'ụbụrụisi ka ahụ mmadụ na-emepụta ya. Nke a mere na streesi na-eme ka hormone ahụ hapụ imepụta tetestorone etu o kwesiri. Ọrịa mmekọ nwoke na Nwaanyị Ufọdụ ọria mmekọ nwoke na nwaanyị na-ebute ọdachị uze Uche Nwagha kwuru na otu ihe ọzọ di ezigbo mkpa na ebute ọdachị uze nwoke bu ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị. Ọ kọwara na ụfọdụ ọria ndị a anaghị egosi njirimara nke mere na mmadụ ga-enwe ya ma ọ maghị. O kwuru na ọrịa ndi a na-awakpo mkpụrụ amu na ahụike amụ nke na ebutere uze nwoke mmadu ọdachị. Kedụ ihe mmadụ ga-eme? Mkpụrụ osisi na akwụkwọ nrị na adị mma maka uze nwoke Dọkịnta Nwagha nyere ụfọdụ ndụmọdụ nke gụnyere mmadu iri nri akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi. O kwukwara ka mmadụ nwee nanị otu onye ya na ya na-eme mmeko ma ọ bụghi ya ka onye ahụ gbochie onwe ya n'ụzo dịka iyi okpu nnabuehi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-46689530,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46689530,"Aisha, nwa mahadum Zaria akwụọla ụdọ","Akụkọ dị mkpa taa: Aisha , nwa mahadum Zaria akwụọla ụdọ","Ozi si n'aka ndị uweojii Kaduna steeti na-ekwu na otu nwa ada a kpọrọ Aisha Abdulganiy akwụgbola onwe ya na Zaria. Abdulganiy, onye bụ nwa ụlọakwụkwọ mahadụm Ahmadu Bello University Zaria nọ n'afọ atọ ya, ṅụrụ nsị were gbuo onwe ya. End of Twitter post, 1 N'ozi ọ hapụrụ, Aisha kwuru ka a taa nne na nna ya, ọkachasị nne ya, ụta maka ọnwụ ya. O kwuru na nne ya anyụọla ya anya n'ụwa ya pụtara. N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kaduna steeti bụ Yakubu Sabo gwara BBC na ""Aisha Abdulganiy nụrụ ihe a na-eche na ọ bụ nsị. "" E buga ya ụlọọgwụ ebe dọkita kwuru na ọ nwụọla pịị."" ""Anyị akpọọla ndị mụrụ ya, ha nyekwara anyị ozi ihe mere."" Sabo gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na-enyocha ka ya bụ ihe siri mee. Otu akpụpụla Buhari ụlọikpe Otu jịkọrọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị na gọọmenti a kpọrọ 'Coalition Of United Political Parties' CUPP n'ichafu agbala onyeisiala Muhammadụ Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abụja maka atụmatụ iji ọnwa isii dọtịa oge onyeisi uweojii bụ Ibrahim Idris ga-anọ n'ọkwa ya. Ọnụ na-ekwuru otu CUPP bụ Ikenga Imo Ugochinyere, kwuru na Idris kwesiri ịla ezumike nka n'abalị iri na ise nke ọnwa Janụwarị n'afọ 2019. Nkeji ọhụrụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mmadụ 24 na-anata nleta maka ebola agbala ọsọ Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara Na mba Congo, mmadụ iri abụọ na anọ na-anata nleta ana-edebe ndị achọọ inyocha maka ọrịa Ebola esila n'ụlọ ebe edotara ha gbaa ọsọ ndụ dịka ọgbaghara dapụtara ka ndị mba ahu na-eme ngagharịiwe maka nkagbu akagburu ntuliaka onyeisiala e mere ụbọchị Sunday. Ministrị na-ahụ maka ahụike mba ahụ kwuru na mmadụ iri na asaa na ndị ahụ gbara ọsọ bụ ndị enyochala ma hụ na ha enweghi ọrịa ahụ. Ebe enyochabeghị mmadụ asaa. Ụmụ ejima abụọ chọrọ ka otu nwoke lụọ ha Ụmụejima ụmụnwaanyị abụọ arịọla ndị omeiwu mba Austriala ka ha mee iwu ga-ekwe ka nwoke lụọ ọtụtụ nwaanyị n'ime ka ha abụọ nweike ịlụ otu nwoke. Iwu mba Australia mabidoro nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị Anna na Lucy De Cinque, ndị dị afọ iri atọ na atọ ayịala nwoke ahụ afọ isii. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Southhampton ga-ezute Liverpool N'abalị Tọzde ka Southhampton ga-ezute Westham n'asọmpị Premier Ligi, ebe Arsenal ga-ezute Liverpool na Fraide, ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Disemba. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka ọnwụ Alex Badeh Ndị uweojii anwụchiela ndị echere na ọ bụ ha gbaburu onye bụbụ onyeisi ndị aghaelu bụ Alex Badeh Cheta na ndị omekome gbagburu Badeh n'ụbọchị 18 n'ọnwa disemba dịka o si n'ubi ya alọta n'okporoụzọ Abuja na Keffi. Ndị uweojii ekwuola na ha ga-egosi ndị ntaakụkọ ihu ndị mmadụ ahụ n'oge adịghị anya n'Abuja. Ọzọ Otu onye agha Naịjirịa emeruola ahụ dịka ndị Boko Haram na ndịagha Naịjirịa kwatara ya n'obodo Baga dị na Borno steeti. Ndị agha Naịjirịa depụtara site n'akara Twitter ha na gbara mbọ chụsasịa ndị oyindụegwu ahụ chọburu ịwakpo nakwa chụọ ha ọsọ. Na mba Ofesi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nwiunye yabụ Melania nọ na mba Iraq ugbua dịka ha gara nleta ndịagha ndị Amerịka na-alụ ọgụ ebe ahụ. Ha mere nke a iji kele ndịagha ahụ maka ""ọrụ ha na mmeri ha"". N'egwuregwu, A na-anụ kepu kepu na ọ bụ na mba Ijipt ka a ga-eme asọmpị iko mbna Afrịka n'afọ 2019. Cheta na anapụrụ mba Cameroon ikike ị me ya bụ asọmpị mbụ. Nkeji nke ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 45830306,https://www.bbc.com/igbo/45830306,PDP: Anyị họrọ Peter Obi maka ị kwado NotTooYoungToRun,"""N'ime mmadụ niile ndị a họpụtara, Peter Obi kachasị tozu ọkwa ahụ"" bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere otu PDP Diran Odeyemi gwara BBC n'ekwentị.","O kwukwara na ọ bụghị maka ebe Peter Obi si bụ mpaghara ọwụwa anyanwụ ka Atiku na ndị otu PDP ndị ọzọ jiri họpụta ya. Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na Atiku mere ọfụma ị họpụta Peter Obi n'ihi na ọ bụ nwoke aka ya kwụ ọtọ na-eme ihe o kwuru End of Twitter post, 1 Ebe a na-anụ na Peter Obi na onwe ya emepela akara Twitter nke ya taa mana amabeghị ma ọ bụ nke ezigbo ya. Atiku meriri na ntuliaka emere na mbido October Akụkọ n'ụbọchị Fraide na Atiku Abubakar ahọpụtala onye bụbụ gọvanọ Anambra state bụ Peter Obi dịka onye ga-abụ osote ya. Otu onye na-achọghị ka mara aha ya gwara BBC Igbo na Atiku na Peter Obi mere nzukọ ụnyaahụ. Cheta na otebeghị aka ndị mmadụ bidoro jụwa ma Atiku a ga-ahọrọ Ngozi Okonjo-Iweala, Peter Obi, Ike Ekweremmadu na Soludo dika osote na ntụliaka 2019. Atiku meriri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka imeụlọ PDP mere na mbido October. Kamgbe ahụ ndị mmadụ na-elo onye ga-abụ osote ya. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: @adeyanjudedeji kwuru na nke a gosiri idi n'otu. O jikwa ohere a kele ụmụ Igbo maka atụmaatụ a. @TWEETORACLE kwuru na ihe mere Atiku ji họrọ Peter Obi bụ makana ha abụọ ghọtara ihe gbasara idozi akụ na ụba obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmeri Atiku ga-achịkọta Naịjirịa-Ndị Igbo" afirika-45388647,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45388647,Ụlọuka Katọlik daara na Delta akụgbụọla otu nwata,"Otu nwata dị afọ 11 anwụọla oge otu ụlọụka akpọrọ St. Paul Catholic Church, Ugolo dị n'obodo Okpe n'ime Delta steeti dara ebe a na-eme ekpere n'ụtụtụ taa.","Ihe mberede a mere n'elekere itoolu nke ụtụtụ a ka ndị mmadụ nọ n'ime ụlọụka ahụ na-ekpe ekpere. Onyeisi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Mohammed Mustapha gwara BBC Igbo na ụlọụka kara ezigbo nka nakwa na ha eburola ndị pụtara na ndụ n'ihe mberede a gawa ụlọọgwụ. O kwuru na ugbua ọnaghị enwe ike ikwu ihe mere ụlọ a jiri daa, mana ọ na-eche na ọ bụ maka oteela ha lụrụ ụlọụka a. N'ọnụ okwu ya: ""Ụlọụka a dị afọ 100. Ọ bụ ụlọụka a lụrụ oge ndị ọcha na-achị ala anyị. Ihe a bụ ihe m che mere ka ụlọụka daa mana anyị ka na-eleba anya na mberede a. Onyeisi ndị sineti Naijirịa bụ Bukola Saraki etinyela ọnụ zigara ndị ihe mberede metụtara ozi itiakab'obi site n'akara soshal midia ya taa. N'ime ozi ahụ o gwara aka n'achị Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ha dibe ma kwu kwa na ya jisike enweta enyemaka ebe ha nọ N'ọnụ ""anyị ga-agba mbọ ị hụ na ndị ji ndị ha pụta n'ihe a ga-enweta ọgwụgwọ kwesiri ha"". Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-44212366,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44212366,A nwụchiela nwa mahadum ji egbe ga ohi,"Ndị uweojii nọ na Legos anwụchiela Gideon Bamidele, 19, nwa mahadum (Caleb University),na enyi ya bụ Afeez Anifowoshe, 20,maka iji egbe ezu ohi.","Gideon bụ nwa onye ndọrọndọrọ ọchíchí Gideon, onye nọ afọ nke atọ dịka onye na-agụ Kọmputa Sayensi na mahadum ahụ na enyi ya ji egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ a kpọrọ Olugbenga Otun, onye ọkwọụgbọala Uber ụgbọala ya oge nkata gbudoro ha. Ma oge ha rutere nso ebe a kpọrọ Itowolo Bridge, Gideon wepụtara egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ ọkwọụgbọala ƴa. Ọ bụ ka ha na nwoke ahụ na-agbarita ka ha nwere ihe mberede mere ka ụgbọala ahụ ṣọgharịa. Onye ọkwọụgbọala ahụ tiri mkpu enyemaka nke kpọkọbara ndị mmadụ nke gụnyere ndị uweojii. Oge onye ntaakụkọ BBC gbara Gideon ajụjụ ọnụ ihe tinyere ya n' izu ohi, o kwuru na ọ bụ ajọ enyi nakwa ịnụ anwụrụike. Gideon Bamidele na Afeez Anifowoshe chọrọ ịnapụ onye Uber ụgbọala Toyota Corolla ya Gideon, onye bụ nwa otu onye ndọrọndọrọvchịchị a maara ama na mpaghara Surulere (nke a chọghị ịkpọ aha ya) kwuru n'anya mmiri sị: ""Amaghị m ihe banyere m n'ime mere ka m banye na Shoprite zụrụ egbe ụmụaka ụbọchị ụka ma gwa nwata nwoke imara ka anyị were ya rụọ ọrụ."" Onyeisi ndị uweojii na Legos bụ Imohimin Edgal kọwara na ndị uweojii na- eme nyocha n'okwu ahụ. Na ha ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma ha mecha nchọpụta ha. Akụkọ ga-amasị:" afirika-47684903,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47684903,Nigeria vs Egypt: Nigeria amịala Egypt ka ịsam,Otu Super Eagles nke Naịjirịa ejirila otu ọkpụ goolu gbaka neetị ndị mba Igipt mgbe ha zutere na mgbede Tuusde.,"Ọ bụ Paul Onuachu nyere goolu zọpụtara isi Naịjirịa na-agba nke mbụ n'asọmpị ahụ. Ndị mmadụ tụrụ anya na onye ọgbaa bọọlụ a ma ama bụ Mohammed Sala ga-apụta n'asọmpị ahụ mana ọ bịaghị. Trump na mgbidi ya. Trump Sịzị sị mewe ngwangwa bia gbaa ya ajụjụ ọnụ maka ebubo a na-ebo ya Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enwetala otu ijeri dọla n'aka ngalaba nchekwa Pentagon dị na mba Amerịka. Ego a bụ nke ọ chọrọ iji rụọ mgbidi ga-ekewa mba Amerịka nakwa mba Mexico. Ọ bụkwa ego nke mbụ n'okpuru gbata gbata mba ahụ nke Trump kwupụtara mgbe ọ gbachichara ndị ụlọomeiwu Amerịka nkịtị n'ikweta inye ego eji arụ ya bụ mgbidi o kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị. Gịnị butere nke a? Trump ekwuola na ihe na-eme n'akụkụ mgbidi ahụ akarịala ihe anya na-ahụ, nke mere na ọ bụ nanị mgbidi ga-akwụsị ndị omekome ịbata mba Amerịka. O nwere ndị iwe na-ewe maka ego a? Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Democrat agbarụọla ihu na-ekwu na anataghị ha ohere wee wepụta ya bụ otu ijeri dọla. Cheta na ndị ụlọomeiwu jụrụ ịnye ya ya bụ ego na mbụ nke mere na agbachiri gọọmentị Amerịka ihe karịrị otu izuụka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-48135421,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48135421,Tonto Dikeh: Ihe Churchill sara ebubo o boro ya,Ọtụtụ ndị a ma ama na-eme ihe nkiri ekwuputela uche ha gbasara ihe Tonto Dikeh kọwara ndị ntaakụkọ maka di ọlụbụrụ.,"Churchill bụ di ọlụbụrụ kwuru na ọ bụ amara na-eche ya ma nwekwa obi ekele. End of Instagram post, 1 Nke ndị mmadụ sonyere n'ụtụtụ a bụ ọzọ na-akpọtụ n'etiti Tonto na Ik Ogbonna bụkwa onye na-eme ihe nkiri Ik Ogbonna gwara ya n'elu instagram na tupu o mee ihe ọ bụla n'elu soshal midia ya cheta nwa ya nwoke. Lee ihe Tonto sara ya: @renoomokri kwuru na ọdịghị mma ka mmadụ na-ekwucha ihe ọjọ niile ọ ma maka di ọlụbụrụ maọbụ onye ọyịbụrụ. Funke Adesiyan sokwa na ndị manyere ọnụ n'okwu a mana ndị mmadụ pụtara katọọ ya. A mabeghị mgbe okwu a ga-ebi mana anyị ka nọ ma na-ewetere ụnụ ka o si gaa. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-52619009,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52619009,"International Nurses Day: ""Ndị nọọsụ na-akọ asịrị nnukwu"" na ihe ndị ọzọ ndị Naịjirịa ji echeta ha taa",Ụbọchị 12 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị e wepụtara maka icheta ndị nọọsụ n'ụwa niile.,"Ndị nọọsụ na-agba mbọ n'inyere ndị dọkịta aka n'ihe gbasara ilekọta ahụike ndị e tinyere ha n'aka. Mana kedụ etu ndị Naịjirịa si ahụta ndị nọọsụ na-arụ ọrụ na Naịjirịa? BBC Igbo jụrụ ajụjụ a na soshal midia Facebook na Instagram, ụfọdụ kwadoro ọrụ ọma ha na-arụ, ebe ndị ọzọ kwuru na ụfọdụ n'ime ha anaghị arụ ọrụ etu ndị nọọsụ kwesịrị isi arụ. Ụfọdụ ihe ha kwuru gụnyere ""Ndị nọọsụ na-akọ asịrị"", ""ndị nọọsụ enweghi ndidi nke ha ji enwe obi ọmiiko"". Ndị ọzọ kwuru sị na ""ha kwesịrị iji obi mmadụ na obi Chineke arụ ọrụ ha"" Mana ndị nke ọrụ ndị nọọsụ na-amasị nke ọma gara n'ihu kpeere ha ekpere, ma sị ka Chineke gbaa ha ume ma nye ha ike ha ji arụsi ọrụ ha ike. Lee ajụjụ a jụrụ ha na etu ha si zaa ihe ha zara ebe a: Lee tu ha si zaa ya n'Instagram: Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coronavirus: Dọkịta na-arụ ọrụ n’ụlọ ogwụ dị n’Amerịka n’oge a" afirika-51630742,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51630742,Coronavirus in Nigeria: 'Ọtanisi ọzọ na-abịa kee nụ nkwụcha' - Ndị ọkammụta,"Dịka ọnụọgụgụ ndị coronavirus metutara na-arịgo na mba ụwa, mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-akpọ isi n'ala kwa ụbọchị.","Otu ahụ ka akụnaụba mba niile sịkwa akpụ afọ n'ala. Naịjirịa nweburu olileanya na ha ga-ere mmanụ agbidi ihe uru $57 otu drọm, mana ụgbụa maka ọgbatauhie coronavirus butere ya na agwa ndị Saụdị Arebịa kpara na ahaa mmanụ, ya bụ ebumnụche anyụọla ka ọkụ. Nke a mere BBC jiri kpọwa ndị ọkammụta ka ha gbaa afa ihe Naịjirịa nwere ike ime n'oge dị otu a. Ọkammụta na Mahadum Nasarawa steeti bụ Uche Uwaleke bụ ọkamụta na okwụ akụ na ụba sị onye ọbụla kee ajị n'ume. O kwukwere ihe ndị a: Prof. Uche Uwaleke bụbu kọmishona na ahụ maka akụ na ụba n'Imo steeti Uwaleke gara n'ihu sị na ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, na ihe mere Naịjriịa na afọ 2016 (Recession) ga-eme ha ọzọ. Onye ọkanchọcha ọzọ bụ Okey Ikechukwu tiri mkpụ sị na ịnwe olileanya n'ọnọdụ Naịjirịa ugbua siri ike. Ọ dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla kee aji n'ume maka ọtanisi na-abịanụ. Ikechukwu, dịka Uwaleke, kwetara na ihe mbụ bụ gọọmenti ịkwụsị amụma ibite ego n'ụzọ ọbụla ugbua. Okey Ikechukwu bụ ọkachamara n'okwu gbara ọchichị obodo Ikechukwu sị onye ọbụla kee nkwụcha maka ọtanisi na-abịanụ. Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha beleta oke njem na-enweghị isi nke nwere ike ibutere ha ọrịa coronavirus na-amaghị ama. Ihe ndị ahịa kwuru maka etu Coroniavirus si emetụta azụmmahịa Uchechukwu Ayaji na-ebubeta ngwaahịa ekwentị na Legọs na-ekwu na ya bụ ihe ji ha n'onu ugbua maka na o nweghịzị ngwaahịa ọhụrụ na-abata. Otu onye bụ isiahurukwawa okpu n'ịkụ ọgwụ bụ Chinedu Obiako bi n'Enugwu sị ya bụ ọrịa metutara ahịa ha nke ukwu. Obiakọ sị na ahịa ogwu ha na-azụ ""tinyere ego ugburu ise maka ụkọ ngwaahịa ahụ n'ahịa"". Uchechukwu Ayaji na-azụ ahịa ekwentị na Legọs Ọ sị na ndị Chaịna kpọchitere ngwaahịa niile ndị mmadụ zụrụ azụ makana o zughịrị mba ha iji zọọ ndị mmadụ ndụ. Obiako sị ndị Chaịna ""na-akwụghachi ndị nwe ngwaahịa ahụ ụgwọ ha ugboro ise"". Ọ sị na ihe a butere ụkọ ngwaahịa gbasara ahụike na Naịjirịa ma meekwa ka ndị dị adị gara oke ọnụ. Chinedu Obiako na-azụ ahịa ọgwụ Obiakọ kwukwara na ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa maka na ọ bụ mba bụ naanị oriri ka ha na-eri, ha anaghị emepụta emepụta. O kwukwara na iwu ji usoro imepụta ngwaahịa na Naịjirịa tara akpụ nke bụ na ọ ka ngaraọnụ imepụta ngwaahịa ebe a karịa ibubeta ya. Ụlọọrụ ndị na-ahụ maka orire azụmahịa nke a na-akpọ 'Nigerian stock market' sị na ọnụọgụgụ dara ruo 2 .5% n'ụbọchị Monde. Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara orire azụmahịa stọk bụ Kasimu Garba Kurfi sị nagbanyeghi na o metutala ọtụtụ ụlọ ahịa ụfọdụ na Naịjirịa, mana ikikere ụlọọrụ anọ maọbụ ise enyela ahịa stọk Naịjirịa ịkwụọtọ. Kurfi sị na ụlọọrụ ndị a bụ Dangote Cement, MTN, AIRTEL na Nestle. Ụlọọrụ ndị a bu ihe karịrị pasent 65 (65%) stọk n'ahịa obodo niile na Naịjirịa. Kurfi sị na ndị ọzọ ejila 10 maọbụ 100% daa na Naịjirịa. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-50683678,https://www.bbc.com/igbo/afirika-50683678,"Nnewi, Awka na obodo ndi ọzọ nwere anụmanụ ha na-akwanyere ugwu","N'obodo dị icheiche n'ala Igbo, anụmanụ ụfọdụ na-enwe ugwu puruiche.","Obodo Ọka na-akwanyere enwe nnukwu ugwu Ụfọdụ n'ime ha ka a na-efe dịka chi, ebe ụfọdụ bụ ndị a na-akwanyere ugwu. Obodo ọbụla nwere ihe kpatara ha ji akwanyere anụmanụ ndị a ugwu. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a: Awka na enwe Content is not available End of Facebook post, 1 N'emume Imo Ọka nke afọ 2019, BBC Igbo gbara otu onye ihe gbasara ọdịnala doro anya ajụjụ ọnụ ihe kpatara obodo Ọka ji akwanyere enwe ugwu. Aha nwa madi ahụ bụ N'okwu ya, ""mgbe gboo, enwe bụ ihe na-agbara ndị Ọka ama."" ""O nwee ihe ọbụla chọrọ ime onye Ọka, enwe ga'apụta gbaa ya bụ ama sị onye ọbụla emela ihe dị otu a maọbụ otu a."" ""Ọ bụrụ na ihe nsogbu dị n'ụzọ, ọbụ enwe na-agba ya bụ ama."" ""Nke a mere ka ndị Ọka were enwe dịka nwanne ha, we kwuo na a ga na-akwanyere ya ugwu."" Na nke dịkwa ka ya, obodo a kpọrọ Imerienwe nke dị n'okpuru ọchịchị Ngor Okpala n'Imo Steeti na-asọpụkwara enwe. Nke a gosikwara n'aha obodo ahụ nke bụ IME-ERI-ENWE. Idemmili na Eke N'akụkọ ụfọdụ, a na-efe eke ka chi. Onye Igbo ọbụla nụrụ ebe a kpọrọ Idemmili, ihe ọzọ ga-agbata ya n'obi bụ eke. Ọbụghị naanị na Idemmili na-asọ anụ eke, ụfọdụ na-efe ya bụ anụmanụ ka chi na mpaghara ụfọdụ n'Idemmili. Site n'Ogidi, ruo Obosi, si Oba ruo Okpoko na Ojoto eke bụ anụ nwere nnukwu ugwu. Ndị na-efe eke na-akpọ ya nne n'ihi na ha sị na eke bu onye ozi ala. Eke na-egosikwa mma pụrụ iche nakwa ịdị nwayọ. N'obodo a na-asọpụrụ eke, onye ọbụla gburu ya ga-akwa ya etu e si akwa mmadu. Na mpaghara Ideatọ nke Imo State, e nwere ụdị eke a na-akpọ Ịkpụtụ bụ nke a na-akwanyere ugwu. Ụdị a abụghị ụdị eke nke idemmili. Ịkpụtụ na-atụ agwa, makwaa mma ile anya, mana ọ naghị ebucha ibu ka eke. Ịkpụtụ anaghị achọ okwu, nke ọ na-ata arụ. Ọ bụrụ na ịkpụtụ nọchie ụzọ, onye ọbụla hụrụ ya ga-eti mkpu sị ""ịkpụtụ lekwa ndị ụka o."" Mgbe ọbụ e tiri mkpu a, ịkpụtụ ahụ na-eji nwayọ rịbanye n'ime ọhịa. Agulu na Aguiyi Aguiyi bụ anụ a na-akwanyere ugwu n'obodo Agulu nke dị n'okpuruọchịchị Anaocha na steeti Anambara. Aguiyi na-adị n'osimiri obodo ahụ a kpọrọ 'Agulu Lake', mana onweghị onye na-egbu ya maọbụ merụọ ya ahụ. E kwenyere na anụ ahụ bụ Chukwu zitere ya ka o chekwaa obodo ha. N'oge gboo, ndị mmadụ na-eji uri see aguiyi n'ahụ ha maka nchekwa. Ha na-esekwa ya n'ahụ ụlọ. Lejja na Mbe Lejja bụ Obodo dị na Nsukka na Steeti Enugwu. E ji ịkpụ ụzụ mara obodo Lejja mana ihe ọzọkwa e ji mara ha bụ Mbe maọbụ Mbekwu. Uchechukwu Evelyn Madu, onye ọka mmụta n'ihe gbasara akụkọ ifo Igbo kọwara ya nke ọma n'ime akwụkwọ nnyocha ya. Ọ kọwara na mbe bụ anụ kacha mkpa arụsị obodo ha na-ana. Mgbe ọbụla a chọrọ ịchụ aja iji sachaa ala, arụsị na-asị ka e weta mbe. Ihe kpatara nke a bụ maka na anaghị ahụ mbe kwadaa. Ndi obodo na-asọpụrụ mbe n'ihi na ha sị na ọbụ anụ ka masị arụsị ha. Nnewi na ewi Nsọala n'obodo ụfọdụ n'Igbo Nnewi na-asọpụrụ Ewi. Ha anaghị ekwere ya ọnya dịka obodo ndị ọzọ si eme. Ha anaghịkwa eri anụ ya eri. O nwere ike bụrụ maka na ewi dị n'aha anụ ahụ nke mere na ndị Nnewi ji akwanye ya ugwu. Otu onye kọọrọ BBC Igbo n'oge gara aga na onye Nnewi ọbụla kachiri rie anụ ewiga-atakwute ya kọnkịrị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha" afirika-43257521,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43257521,Dapchi: A chọtala ụmụakwụkwọ atọro na Yobe Steeti?,"Taa mere ụbọchị nke iri otu na otu (11) a tọrọ ụmụakwụkwọ na-agụ akwukwọ na Girls Government Girls Science and Technical College (GGSTC) ,Dapchi, Yobe steeti ruru notu nari na iri.","A tọrọ ụmụakwụkwọ 110 a n'ọnwa Februwarị Akwụkwọ ozi ndị isi ọchịchị Naijiria depụtara na-ekwu na ha ga-ebido chọwa ha n'obodo ndị agbataobi Naijiria. Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala nke gọọmenti Naijiria bụ Lai Mohammed depụtara akwụkwọ ozi a. N'ime ya,o kwuru na ndị isi ndị agha akwarala gawa Ugwu Awụsa ka were kwado mbọ ịchọ ụmụ aka ahụ na-efu efu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị sonyere na njem a bụ ndị agha Naijiria gbalitere n'ọkwa. Ha gụnyere Gen. Abayomi Olonisakin,Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas; Chief of Army Staff; Lt.-Gen.Tukur,Buratai na Alhaji Lawal Daura. Ha sonyere onyeisi ndị agha ụgbọelụ bụ Air Marshal Sadique Abubakar,onye nke kwagarala Ugwu Hausa. Na mbu, gọọmentị etiti na nke Yobe steeti na-agọ na onweghị ụmụaka na-efu ebe ha kwuru na ha achọtala ha. O bụ mgbe ndị nwe ụmụ aka ndị bidoro tiwe mkpu na-ha ahụ beghị ụmụ ha magbakọ dekọta aha mmadụ nari ise ka gọọmentị kwetara na mmadụ otu narị na iiri na-efu kemgbe ndị Boko Haramwakporo ụlọ akwụkwọ ha n'onwa Februwarị iri na itoolu. E wepụtakwara kọmiti ga-enyocha ihe niile gbasara ntọ ụmụaka ahụ." 48979770,https://www.bbc.com/igbo/48979770,Killings in Nigeria: IGP enyela iwu ka ahazigharịa ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa anyanwụ,"Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu ekwuola na oge eruola mgbe a ga-ebufeta amụma gbanụgbanụ ha kpọrọ ""Operation Puff Adder"" na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa iji gbochie mkpamkpa ndị omekome nke juru ebe nille ugbua.","Amụmụ a bụ usoro ha ji bagide nchekwa n'okporo ụzọ si Kaduna gawa Abụja bụ ebe ndị omekome na-akpa nkonko ka ha sị na ha ga-eji mee ndị ekperima a taa kpuchie ọnụ na okporo ụzọ awara awara niile dị n'ala Igbo. Nke a na-abịa ka ndị ekperima a gbuchara ada onyeisi ndị Afenifere bụ Funke Olakunrin ụbọchị Fraịde n'okporo ụzọ awara awara dị n'Ore. Adamu sị na nke a ga-eme ka omere mbụ ghara ịme ọzọ. Ya bụ onyeisi ndị uweojii sị na ya bụ Funke Olakunrin egburu egbu bụ Reuben Fasorantin na ha ga-ama imi n'ala chọpụta ha bụ ndị ihe ọma na-asa afọ merụrụ ya bụ ala ma taa ha ahụhụ ka iwu kwuru. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba sị na ha ehibelaarị ndị isi ekwu ọnwụ ga ahụ na-achọtara ndị ọjọọ a. Ogbugbu nwaanyị emela ka ọtụtụ mmadụ tie mkpu maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. Ka ọ dị ugbua, osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agbaala ọkpa na be Pa Reuben Fasorantin n'Ondo steeti ịga tie ya aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Funke Olakunrin. Osinbajo kwetere n'ezie na nchekwa Naịjirịa fọrọ nkwanye ọkụ ka ya bụ nri ghee, mana na gọọmentị na-eme ihe niile ịhụ na udo lahachitere azụ n'obodo a. Akụkọ ga-amasị gị" egwuregwu-44675352,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44675352,World Cup 2018: Kedụ ụmụntakịrị na-enwu ka kpakpando?,"Dika Iko Mbaụwa banyere agba nke abụọ, enwela ""ndị na-ọchị ndị na-akwa"" nke turu uwa n'anya.","Mbappe gbara afọ 19 ma na agbara PSG na Frans Ọtụtụ obodo bụ isi afụrụ kwawa okpụ na asompị mba ụwa ebola aka emeri n'isi. Dịka ya bụ akwa na-ada, obodo ndị a bụ ochiedike n'egwu bọọlụ dukwa ndị otu ha ala. Fisht Olympic Stedịọm na Sochi Nke a pụtara na dịka Messi, Ronaldo, Aguero, Huigain, Lewandosky, Muller, Kroos na ndị ọzọ kwarala lii, ụmụmmbị ndị na-awapụta: Hirving Lozano nke Mexico Amụrụ Lozano na 30 July 1995 Nwaamadị a gbara afọ 22 na-agbara PSV. Ogbaala bọọlụ ugboro atọ na Iko Mbaụwa ma nyekwa otu gọọlụ bụ nke Mexiko jiri merie ndị Jamani. Aleksandr Sergeyevich Golovin Amụrụ Golovin na 30 May 1996 Aleksandr Sergeyevich Golovin na-agbara CSKA Moscow. Onyekwara otu gool na Iko Mbaụwa a ma kparakwa otu mpempe akwụkwọ edoedo eji adọ ya aka na ntị maka iri-mperi n'egwu bọọlụ. Yerry Mina Yerry Mina dí afó 23 Barcelona na obodo ya bụ Kolumbia Ọ bụ isi Yerry Mina nyere goolụ chụpụrụ ndị Sinigal na Iko Mbaụwa a. Kylian Mbappé Mbappe gbara afọ 19 ma na agbara PSG na Frans Mbappe enyela goolu atọ ugbua, abụọ n'ime ha ka o ji nyụọ ndị Ajentina ịkpakwụ bụ nke e ji gbaara ha ụgbọnwamkpị n'Iko Mbaụwa a. Akụkọ ga-amasị gị" 42802132,https://www.bbc.com/igbo/42802132,Ndị oyi egwu n'Afghanistan awakpola obodo Jalalabad,"Ndị omekataraihepụụjọ a na-akpọ terrorists na bekee, gbaraa ogbunigwe tupu ha wakpo ụlọ ọrụ ebe a na-elekọta ụmụaka n' obodo Jalalabad dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Afghanistan.","Onye ogbunigwe mgbagbu onwe gbara otu ụgbọala nọ n'ihu ụlọ nlekọta ụmụaka Dịka otu onye ọrụ gọọmenti kwuru, ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla, ebe mmadụ iri na otu nwere mmerụ ahụ. Ihe ruru ndị ọrụ mmadụ iri ise nọ n'ime ụlọ ahụ mgbe ndị wakpọrọ ya. Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ atọ bu egbe bụ ndị sọ na mwakpo ahụ, ebe a ka na-alụ ọgụ n'elụ ụlọ ahụ. Onwebeghị ndị kwuru na ọ bụ ha mere ihe a. Kedu ihe bụ ihe ọhụrụ? Dịka Attaullah Khogyani, onye na-ekwuchite ọnụ onye Gọvanọ nke mpaghara Nangarhar siri gwa BBC, ihe mwakpo a bidoro mgbe ojiri ọkara gafe elekere anọ nke isi ụtụtụ mgbe otu onye oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe gbara otu ụgbọala nọ n'ihu ụlọ nlekọta ụmụaka Anya hụrụ ka o siri mee gwara ndị ntaakụkọ AFP na ọ hụrụ otu onye n'ime ndị ahụ ka o jiri egbe ukwu a na-akpọ RPG na-akwa ọnụ ụzọ ụlọ ọrụ ahụ. Ọgụ gara n'ihu na mpaghara ebe ihe a mere ụbọchị ahụ niile Kepu kepu BBC nụrụ kwuru na a gbagbuola mmadụ abụọ n'ime ndị oyi egwu ahụ. E nwere ọtụtụ ndị ụlọ ọrụ nọ n'ebe ahụ gunyekwara ụlọ ọrụ ndị gọọmenti." afirika-51582968,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51582968,Abacha Loot: Mba Amerịka abụrụla agada gbachiri ụzọ n'ego ọzọ chọrọ ịbata Naịjiria,Mba Amerịka akwụchiela n'ụzo na a gaghị enye Naịjirịa nde dọla otu narị ọzọ bụ nke a hụtara n'ọbaego Sani Abacha na mba ha.,"Iwe Amerịka bụ na Naịjirịa na onye ha sị nyerela Abacha aka bupu ego a bụ Abubakar Bagudu, ga-eke ya bụ ego. Bagudu bụ aka na-achị Kebbi steeti ugbua. Ndị Shia 100 enwerela onwe ha Ụlọikpe dị na Kaduna steeti ekwuola na ikpe amaghị mmadụ otu narị bụ ndị otu Shia akpọrọ Islamic Movement in Naijiria. Nke a na-ebute ikpe ha nke gọọmentị Kaduna steeti gbara ha akwụkwọ maka mwakpo ndịagha Naịjirịa n'afọ 2015, n'isi njedebe. Onyeisiala mba Lesotho ekwuola ihe mere o ji ọ bịaghị ụlọikpe Thomas Thabane ekwuola na ọ ga-aritu n'oche ọchịchị n'ọnwa Julaị Thomas Thabane bụ onyeisiala mba Lesotho agọrọla ọnụ ya sị na ọ bụghị ọsọ ka ọ gbagara na mba Saụt Afrịka, kama na ọ bụ ahụ ya ka ọ gara ilekọta. Nke a na-abịa dịka ọ ghara ịpụta n'ụlọikpe bịa zara ọnụ ya ugboro abụọ maka ogbugbu nwunye ya nke mbụ. N'egwuregwu, Jurgen Klopp bụ onye nchịkọta Liverpool ekwuola na Jordan Henderson bụ onye ndu ya agaghị agba bọolụ n'ime izu atọ na-abịa maka mmerụ ahụ. Jordan Henderson pụrụ n'ọgbọ egwuregwuna nkeji 80 oge Liverpool na Atletico Madrid zutere Ndị ụweojii na-enyocha ụlọ gbara ụmụaka ọkụ Ndị uweojii Anambra Steeti sị na ha ka na-enyocha ọkụ gbagburu ụmụaka atọ n'ọkpuruọchịchị Iheala nke steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ọkụ gbagburu ụmụaka atọ ahụ. Akwụkwọ akụkọ buru na nne na nna ụmụaka ahụ hapụrụ ha pụọ n'abalị mgbe ya bụ ọkụ gbara ụlọ ha. Akụkọ ndị a kwukwara na nna ụmụaka ahụ gara itiegwu ebe a na-eme emume ebe nne ha gbaara arabanko nke ya gawa. Ha sị na ndị agbataobi gwara ha na nne ha mụnyere uriọkụ n'ụlọ ahụ wee pụọwa. Ha chere na ọ bụ ya bụ uriọkụ Bekee a kpọrọ ""candle' ka ya bụ ọkụ si banye n'ụlọ were gbagbuo ụmụaka ahụ na ngwongwo ndị ọzọ. NSCDC sị na ha ga-akpụpụ ehi ụlọikpe Nigeria Security and Civil Defence Corp (NSCDC) ekwuola na ha ga-akpọpụ ehi iri anọ na atọ ụlọikpe ma ọ bụrụ na ndị nwe ha apụtaghị. Afolabi Tolulope bụ ọnụ na-ekwuru ndị Nigeria Security and Civil Defence Corp (NSCDC) n'Ekiti steeti bụ ndị jidere ehi iri anọ na atọ na-emebi ihe ndị mmadụ n'ugbo. Ndị nwe ya bụ ehi ejidere n'Orin-Ekiti gbara ọsọ kamgbe ahụ Ndị ọrụ (NSCDC) kpọrọ ehi ndị a kamgbe na-eche ka ndị nwe ha bịa zaa ajụjụ ma bịa kpọrọ ha. Mana kemgbe ahụ ahụbeghị ha, ebe ndị ọrụ ha nọ na-enye ehi ndị ahụ nri. Ụgbụa, Tolulope na-ekwu na ike ha ji azụ ya bụ ehi nrị agwụla ha ma sịkwa na ọ bụrụ na ndị nwe ya apụtaghị na ha ga-akpọpụ ehi ndị ahụ ụlọikpe ga nata ụlọikpe ikike ire ha ma were ego ha kpọchie ego ha mefuru ma kwụkwa a ndị ha mebiri ihe ha ụgwọ. NSCDC kwuru na ha etiela mkpu n'ọha ọkachasị n'aka otu na-achị ehi mana onwebeghị onye pụtara. Mbata ndị NSCDC na ya bụ okwu gbochiri ndị obodo igbu ya bụ ehi mgbe ha mebiri ihe ha bụ nke ha sị dị oke ọnụ. A chawala Trump ọkụ ọzọ A malitela ịcha ọnyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ọkụ ọzọ dịka okwu ịchụpụ ya n'ọchịchị magoro afọ n'ala. Ngalaba na-ahụ maka nyocha nzuzo na ụlọomiwu obele nke Ameịka sị ewere kepu kepu na Russia chọrọ inyere Trump aka na ntuliaka ha na-akwado na Nọvemba. Victor Moses nọ n'egwu Nwa afọ Naịjirịa bụ Victor Moses so n'egwu oge ndị Inter Milan nke mba Italy meriri Ludogorets n'asọmpi Europa League n'abalị Tọzde. Nke a bụ asọmpi nke isii Moses na-agba kamgbe o si Fernabache gafee Inter n'ọnwa Janụwarị. Naịjria arịọla ka Amerika maka mmachị amachiri ha Naịjirịa agwala mba Amerịka ka o kagbuo usoro ọhụrụ mba ahụ wepụtara maka etu ọ ga-esi na-anabata ndị Naijirịa na mba ha. Ọ bụ Fraide bụ ụbọchị nke 21 n'ọnwa Febụwarị ka atụmatụ a malitere. Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gunyere Naịjirịa n'ime mba ise ndi ọzọ ga-eso n'ime mba ndị ọ chabịri ohere ha ga-eji bata mba Amerịka. Agbanyeghi na ọtụtụ mmadu na-agbarụ ihe maka atumatụ a, ndi ọru gọọmentị Amerịka si na ọ bụ maka mba ndị a dara atụmatụ eji enyocha ma kesa mpụtara nyocha ndi mmadụ butere mkpachi a fesara Naịjirịa na ndị ọzọ. Ọ bụ onyeisi Ministri na-ahụ maka obodo bụ Maazị Aregbesola rịọrọ arịrọ n'aha Naijirịa. Ọ sị: ""Naịjirịa dị mkpa dịka ezigbote ọyi Amerịka nke mere okwesighi enwete ụdịrị mgbochi a."" Maka nwaanyị amara Ikpe ọnwụ Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Nwaanyị amara ikpe ọnwụ n'Abụja maka na ọ gburu di ya amalitela njem ikagbu mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị. Maryam Sanda sị na ya bụ ikpe amara ya ezighị ezi maka na-enweghị ezigbo ihe akaebe eji maa ya ya bụ ikpe. Saụt Korịa na Coronavirus N'ofesi, mba Saụt Koria ekeele nkwụcha gbasara ọrịa Coronavirus dịka ọ ji iwe na agirima abata n'obodo ha. Prime Minster mba ahụ bụ Chung Sye-kyun sị na ya bụ ịkwe n'aka agafewala nkoaka dịka ya bụ ọrịa jidegoro mmadụ dị otu narị iri ise na isii. Maka Europa League N'egwuregwu asọmpi Europa League agbaara na Tọzde Wolverhampton Wanderers jị ọkpụ goolu anọ mme Espanyol taa kpuchie ọnụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ meriee Olypiakos. Club Bruges na Mancheter United ji otu ọkpụ otu ọkpụ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa. Gee akụkọ ndị a na otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-53312059,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53312059,Ibrahim Magu: A tọhapụla Ibrahim Magu bụ onye e ji eji kemgbe abalị iri,Akụkọ na-eru anyi ntị ugbua bụ na Ibrahim Magu bụbu onye nnọchite anya ndị isi EFCC e nwerele onwe ya na n'aka ndị uweojii ngalaba nke onyeisiala na mgbede Wenezde.,"Cheta a nwuchiri Magu n'ụzọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị maka ebubo nruruaka ha sị na o metere mgbe ọ nọ n'ọrụ. Ọ bụ Abubakar Malami bụ Minista ikpe nkwumọtọ na Naịjirịa boro ya ya bụ ebubo. Chetakwa na n'akwụkwọ ha degaara okaiwu Ibrahim Magu ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị, onyennọchite anya onyeisi ndị uweojii bụ onye tinyereaka na ya bụ akwụkwọ bụ Idowu Owohynwa zara okaiwu Magu na ọbụghị ha ji Ibrahim Magu. Na ya bụ akwụkwọ akara ya bụ 7000/IGP.SEC/ABJ/VOL.489/171 onyeisi ndị uweojii sị ọ bụ ndị ngalaba ndị uweojii nke onyeisiala bụ ndị na-enyocha Magu, nke pụtara na ọ nọghị n'aka ha. Okaikpe Magu bụ Tosin Ojaomo Esq. degeere ndị uweojii akwụkwọ ka ha tọhapụ Ibrahim Magu bụ onye e ji eji kemgbe Mọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Julaị. Onyeisi ndị uweojii gwara okeikpe Magu ka ha chọrọ ya gawa n'ụlọọrụ onyeisiala. Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ewepụla onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu n'ọkwa. Otu onye na-arụ ọrụ n'obi gọọmentị bụ Aso Rock gwara BBC nke a. Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Monde ka akụkọ wuru ewu na ndị uweojii pụrụiche bụ DSS nwụchiri ya n'Abuja. Ndị DSS mechara zipute ozi kwuru na akụkọ nwụchi ya abụghị eziokwu. N'otu aka ahụ, ụlọọrụ nke ọ na-eleta anya wepụtakwara ozi nke ha kwuru na o ji aka ya ga zara oku a kpọrọ ya. Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu gwakwara BBC na o nweghi ihe ha ma maka nwụchi Magu ụnyaahụ bụ Monde. Ihe anyị ma maka Ibrahim Magu? Oge ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu, Bukola Saraki na ndị otu ya jụrụ ịkwado Magu ka ọ bụrụ onyeisi EFCC mana Buhari kpọrọ ekwe nkụ họrọ ya Cheta na Magu ka bụ onyeisi nchere oge na EFCC nke Bekee kpọrọ 'acting chairman'. Ugboro abụọ onyeisiala Buhari wegara aha ya na nke ndị omeiwu ukwu, n'afọ 2018 ha jụrụ ịkwado ka Magu bụrụ onyeisi EFCC. N'oge ahụ, ndị uweojii nzuzo bụ DSS dere akwụkwọ na-akatọ Magu, ma kwuo na ya na ndị aka ha adịghị ọcha na-emekọ ihe. Ndị DSS kwuru na Magu na-emekasi ego etu o si masị ya ma kwukwaa na ọ bụ mmadụ kwụọrọ ya ụgwọụlọ ebe o bi n'Abuja. Dịka ha si kwuo oge ahụ, ụgwọụlọ ahụ bụ nde naịra iri anọ (N40 million). Magu gọrọ aka ya na ụkwụ ya n'ebubo ndị ahụ, mana ndị Sineti - nke Bukola Saraki nọ n'isi ya n'oge ahụ - jụrụ ịkwado ya. Mana Buhari jụwara isi ma hapụ Magu ka ọ nọrọ dịka onyeisioche nchereoge. Ebubo ọhụrụ Ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami na Magu enweela nghọtahie ugboro ugboro Ọ bụ ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami boro Magu ebubo nke a mere e ji chutuo ya n'ọkwa. Malami kwuru na aka Magu adịghị ọcha, na ọ na-ezuru ego a natara ndị zuru ego Naịjirịa. Malami kwukwara na Magu anaghị erubere ya isi dịka onye ka ya n'ọkwa na gọọmentị. Nke a mere ka e hibe kọmiti ga-eleba ebubo ndị ahụ anya. Ọ bụ kọmiti ahụ nyere iwu ka e jichie Magu n'ụbọchị Monde. Akụkọ kwuru na ọ rahụrụ n'ogige ndị uweojii." afirika-51923415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51923415,Coronavirus Outbreak: A ga-agbachi okeala na ụgbọelu ifebata na Naịjirịa?,"Ndị ụlọ nnọchịteanya akpọkuola gọọmenti etiti ka machie mfebata ụgbọelu ndị si mba UK, Spen, Ịtalị na mba ndị ọzọ ebe ọrịa coronavirus na-akpa ike ọjọọ.","N'otu aka ahụ ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ji akara a kpọrọ #NigeriaNeedsATravelBan na twitter na-ekwu ka gọọmentị mee nke a. @DrOlufunmilayo sị ka Naịjirịa mee ka ndị ogbo ha Gana; End of Twitter post, 1 @BhadmusAkeem sị na ọ bụ arịrịọ ka ọ na-arịọ onyeisiala Buhari ka o machie nke a; Cheta na mba Afrịka ndị dịka Ghana, Kameruun, Saụt Afrịka adịla mbụ mmechie ụgbọelu si mba ofesi ụfọdụ ifebata na mba ha. Ebe ọtụtụ n'ime ha emechiela ụlọakwụkwọ ha dị iche iche mana onwebeghi nke Naịjirịa mere n'agbanyeghi na mmadụ atọ ebutela coronavirus na Naịjirịa. Ndị dọkịta n'Abuja amalitela abụbụọrụ Ndị dọkịta n'Abuja amalitela abụbụọrụ maka akwụghị ha ụgwọ ruru ha n'agbanyeghi ọrịa coronavirus chere Naịjirịa n'ihu ugbua. Onyeisi ha bụ Roland Osaigbovo sị na akwụbeghi ndị otu ha ụgwọ nakwa na ha enweghi nchekwa n'ụlọọrụ ha. Ebe otu onye dọkịta n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na gọọmentị emeghi ihe ha chọrọ na ha ga-eso ibe ha malite abụbụọrụ nke ha. N'Egwuregwu Otu Uefa agbatịala oge asọmpi Euro 2020 site n'ọnwa Juun afọ a gawa n'ọnwa Juun nke afọ 2021 n'ihi ọrịa coronavirus. N'aka nke ọzọ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Malaga ndị obere bụ Francisco Garcia nwụrụdịka a chọpụtachara na o bu coronavirus. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ndị Igbo ji ekwurekwu ebutere onwe ha nsogbu na Naịjirịa - Onyeisi Ohaneze Legọs Onye nke atọ ebutela coronavirus na Naịjirịa Naịjirịa ewetela onye ọzọ bu nje coronavirus dika ngalaba na-ahụ maka ahụike na Legọs siri dee na akara Twitter ha. Na nkọwa ha, onye bu nje a bụ nwaada dị afọ 30 sị mba Briten bata Naịjirịa n'ụbọchị 13 nke ọnwa Maachi. Dịka ha siri dee, nwata nwaanyị nọ na be ya kemgbe ọ lọtara. ọ bụ ka ọ chọpụtara na ahụ adịghị ya ka e mere ya nyocha chọpụta na o nwere ya bụ nje. Kọmịsọna na-ahụ maka ahụike na Legọs bụ Akin Abayomi sịkwa ka onye ọbụla ji ụgbọelu British Airways febata tinye onwe ha na ihe Bekee kpọrọ ""quarantine"" ruo abalị iri na anọ. A malitela ịnwa ọgwụ mgbochi Coronavirus na mba Amerịka A malitela ịnwa ọgwụ emepụtara maka coronavirus n'ahụ ndị mmadụ wepụtara maka nke a na mba Amerịka. Otu nwaanyị aha ya bụ Jennifer so n'ime ndị a kwuru na ọ bụ ohere iji nye aka nke ya. Ọnụọgụgụ ndị wepụtara onwe ha maka ọnwụnwa eruola mmadụ anọ. Mana ọ ga-eru ọnwa ole na ole tupu a mara ma ọgwụ a na-arụ ọrụ. Udo ga-achị na APC - Oshiomhole APC Chairman Adams Oshiomhole don be Govnor of Edo State before Adams Oshiomhole ekwuola na ọ ga-agba mbọ ịhụ na udo chịrị n'otu APC. O kwuru nke a dịka ụlọikpe mpesa kagburu nchuda nwamgbenata ụlọikpe ukwu n'Abuja nyere ya. Oshiomhole si na mkpebi ahụ enyela ya ohere ịmalitekwa ọrụ ebe ọ kwụsịrị. N'Afrịka, Ndị agha mba Niger egbuola ihe ruru ndị Boko Haram iri ise n'abalị ụbọchị ụka. Otu onye agha Niger nwụrụ n'ọgụ ahu ebe a nwụchiri ọtụtụ ndị Boko Haram ndị ọzọ dịka Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke mba ahụ si kwuo N'Egwuregwu, Egwuregwu di iche iche akwụsịla na mba Briten dịka Praịm Minista Boris Johnson sị ka akwụsị ịpụta n'ọgbakọ ọha n'ịhị ọrịa Coronavirus. Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị na agaghịzị enye ọgbakọ ọbụla nwere ọtụtụ mmadụ ndị ọrụ gbatagbata ga-enye ha aka. Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47088188,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47088188,Ugboro abụọ Buhari tabiri ọnụ n'achumta vootu a,"Ntabi ọnụ bụ ihe mmadu niile n'ụwa dum na-eme kwamgbe kwamgbe, mana ya ihe anyị na-eme echefụ na mbụ bụzị ihe sochal midia nke ụwa ọhụrụ jizi eme akaja.","Ugbua bụ mgbe ndọrọndọrọ ọchịchi, otu onye na-azọ ọkwa ntabi ọnụ a na-emekarị bu onyeisiala Muhamadu Buhari. Inye onye etozughi okọlọtọ pati ha ga-eji zọọ ọkwa gọvanọ so na ntabi ọnụ Buhari na-eme. Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ike agwụla Buhari, nke mere okwesiri ịga zuo ike. Otu n'ime ndị ọru ya bu Festus Keyamo tinyere ọnụ na ya bụ okwu na mkparịtaụka ya na BBC nwere. Keyamo si na o bu ndị sị na Buhari nwere nsogbu nwere nsogbu. Lee ihe okwuru ebe a: Okwu Festus Keyamo maka Buhari Okwu Keyamo a akwụsịghi ndị mmadụ ikwu maka ntabị ọnu ndị a Onyeisiala na-eme. Lee ụfọdụ ihe ha na-arụtụ aka: 1) Nke mere mgbe ọ gara Akwa Ibom. 2) Mgbe ọ kpọrọ onye na-azọ oche gọvanọ na Delta steeti onye na-azo oche onyeisiala. Ka osinadị ntabi ọnụ bụ ihe na-eme ụtụtụ ndị ndọrọndọrọ, ọkachasị ndi na-apụta n'ihe onyonyo." afirika-53127465,https://www.bbc.com/igbo/afirika-53127465,Kara Bridge Fire: Mkpamkpa ọkụ tanker na-akpa n'elu akwammiri a,Nyakasi ụgbọala bu ihe butere ọkụ ọgbụgba tanka na-agba na akwammiri Kara ugbua dịka onyeisi Ụlọọrụ Lagos State Emergency Management Agency si kwuo.,"Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ahụ agbanyeghị na ọkụ nwereike ifesa ha Olufemi Oke-Osanyintolu kwuru na chi fotechara ọfụma na ọ bụ ụgbọala anọ ka ọkụ ahụ ka na-agbatọsi. O kwuru na ụgbọala abụọ n'ime anọ a gụnyere tanka bu mmanụ ụgbọala nakwa gwongworo bu gassi nakwa nke nọ nkịtị. N'okwu ya, anyị emenyụọla ọkụ ahụ site n'enyemaka ndị ụlọọrụ mmenyu ọkụ ndị ọzọ gbatara ọsọ ebe ahụ. Osayintolu kwuru na etu ọ dị ugbua na onwebeghị ozu ebuputere ebe ahụ mana ha ahụla mkpịsị ahụ mmadụ ọkụ gbakasarị. Cheta na Osayintolu depụtara n'ụtụtụ na ọkụ si na tanka abụọ kụkọtara onwe ha ka na-agba na akwammiri Kara dị n'ụzọ Ibadan Expressway dị na Legọs. Kedụ ka o si mee Osayintolu kwuru na tanka bu mmanụ ụgbọala na ibe ya kụkọtara isi nke mere ka nnukwu ọkụ gbawa ebe ahụ. O kwuru na ha ka na-emenyụ ọkụ ahụ n'ụtụtụ a. Ọdachị a emeela na onweghị ndị si ụzọ akwammiri Kara na-abata Legọs ugbua. O butekwara kpachi kpach di egwu n'okporouzọ ahụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Akụkọ ka na-abịa." afirika-43819845,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43819845,Ndị uweojii kwuru na ha na-achọtala ọfọ sineeti,Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: Achụpụla osote onyeisi omeiwu Delta,"Friday Osanebi Ụlọikpe ukwu dị na Kwale, achụpụla Friday Osanebi bụ osote onyeisi omeiwu nke Delta steeti. Ha kwuru na ha chụpụrụ ya maka na ọ tụrụ asị banyere onye obodo ọ bụ. Nchụpụ a na-abịa n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọnọdụ ahụ afọ atọ. Achọtala ọfọ sineeti Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a Ndị uweojii kwuru na ha achọtala ọfọ ndị sineeti ndị omekome zuru ụnyaahụ. Osote ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abuja bụ Aremu Adeniran kwuru nke a n'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara n'ụtụtụ a. O kwukwara na onyeisi ndị uweojii gburugburu Naịjirịa nyere iwu ka ndí uweojiie tinyekwuo uchu na nchekwa ụlọomeiwu ukwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: N'akụkọ mba ofesi Ndị ụlọakụ commonwealth nke Australia bụ CBA n'aha ịchafụ emeela nkwupụta etu ha si na-anara ndị nwụrụ anwụ ego. CBA kwuru na ha naara ndị mmadụ ego na-enyeghị ha ihe ha chọrọ, ka a na-enyocha ha maka mpụ na nrụrụaka gbasara akụnaụba, n'ihu ohaneze. N'egwuregwu Ndị Manchester United gosiri ndị Bournemouth nkarị n'abalị ka ha zutere na Premier league. Ha ji ọkpụ abụọ asataghị ihe (2-0) merie bournemouth. Man. Utd nọ n'ọkwa nke abụọ na tebulu ebe Bournemouth nọ n'ọkwa iri na otu. Nkeji ụtụtụ a: Gere akụkọ nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a na-egosi ka ndị mmadụ na-anwa ihe a na-akpọ 'Lion' n'Igbo. Gịnị bụ ""lion na leopard"" n'Igbo?" afirika-45860178,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45860178,Abia Gas Explosion: Ndị ọkụ gbagburu agbalitela,Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọkụ gaasị gbara n'okporo mmanụ Osisioma dị n'Abịa steeti ụbọchị Friaide arịala ruo 150.,"Onyeisioche ndị eze n'okpuru ọchịchị Osisioma bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu, onye kwupụtara nke a oge Sinatọ na-anọchite mgaghara ahụ n'ụlọomeiwu bụ Sinatọ Theodore Orji gara njem nleta ịhụ ndị ihe a metụtara sịrị n'ọnụọgụgụ gbalitere dịka ọtụtụ e bugara ụlọọgwụ mechara nwụọ. Chiavoghilefu sịrị, ""Ihe dịka mmadụ 70 ndị e bugara n'ụlọọgwụ dị nso n'obi m n'ụbọchị mbụ ihe a mere anwụọla. Ndị nwụrụ anwụ akarịala 150."" N'okwu ya, Orji tụrụ arịrị na ihe butere ọdachi a bụ na ngalaba na-ahụ maka igwupụta na ire mmanụ na Naịjrịa bụ Nigeria National Petroleum Corporation, NNPC, anaghị elechi okporo mmanụ na-ehi nke kpata ọdachie. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-49442911,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49442911,High blood pressure: Ị ma na onye ọ na-eme n'afọ 30 na 40 nwere ike imecha nwee nsogbu n'ụbụrụ?,"Ndị rurula afọ 30 kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha enweghi ọbara mgbali elu iji gbochie ọrịa ụbụrụ mgbe ha kawara nka, dịka nchọpụta si kwuo.","Ndị ruru afọ 30 na-arụkarị ọrụ ma na-elekọtakwa ezinaụlọ Nchọpụta ahụ kọwara na ""oge kacha mkpa"" iji echekwa ahụike ụbụrụ mmadụ bụ site n'oge ahụ ruo mgbe mmadụ karuru mbido afọ 50. Nchọpụta ahụ so mmadụ 500 a mụrụ n'afọ 1946, gosiputara na ọbara mgbali elu mere mmadụ na mbido ""etiti ndụ ya"" nwereike ibute ọrịa ụbụrụ. Nke a abụghị mbụ a na-eche na ọbara mgbalie elu bidoro n'oge nwereike ibute ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka mmadụ na-echefukarị ihe, nke Bekee kpọrọ ""Dementia"", mana ndị ọkammụta sayensị chọrọ ịghọtakwu mgbe nakwa etu o nwereike ime. N'ime oge e mere nchọpụta a nke e biputara n'ọbaozi Lancet Neurology, e nyochara ndị sonyere na ya iji mata ogogo ọbara ha ma nyochakwa ụbụrụ isi ha. A chọpụtara na ọbara mgbali elu mere onye dị ebe afọ 36 ruo afọ 43 butere mpewanye mpe ụbụrụ. 'Iweta mmebi ọsịsọ' Ụbụrụ onye ọbụla na-atalatu obere ka onye na-aka nka, mana ọ na-egosikarị ọfụma na nke ndị na-arịa ọrịa ndị dịka ọkpọnụbụrụ nke Bekee kpọrọ ""Dementia"" bụ ọnọdụ ichefu ihe na-abịakarị n'agadị. Ebe ndị e nyochara egosighi na uche ha ezuchaghị ezu, ndị nnyocha kwuru na ọtịta ụbụrụ na-amalite tupu nke ahụ - nke bụ na ha ga-aga n'ihu na-etinye anya ebe ndị ha nyochara nọ n'afọ ndị na-abịa, iji mara ma ọ ga-emecha mee ha. Ihe mmadụ sere gosiri etu ụbụrụ mmadụ si agba nchefu A chọpụtara na ọbara mgbali elu na-eme ndị dị afọ 43 ruo afọ 53, butere mmebi okporo ọbara na-agba n'ahụ maọbụ ""obere mkpọnwụ ahụ"" oge ndị mmadụ ruwere ebe afọ 70. Ọkammụta Jonathan Schott, onye ọrụ ya bụ inyocha ụbụrụ isi mmadụ na UCL Queen Square Institute of Neurology, du ndị mere nnyocha a. O kwuru sị ""Ọbara mgbali elu, ọbụladị oge anyị dị afọ 30, nwereike inye ụbụrụ mmadụ nsogbu mgbe afọ iri anọ gachara. Nnyocha na mgbochi e ji elekọta ahụike ụbụrụ mgbe onye kawara nka, kwesịrị ịmalite ebe etiti ndụ mmadụ."" Paul Leeson, onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara nlekọta ọrịa obi na mahadum Oxford, kwuru: ""O teela anyị matara na ụfọdụ ndị nwere ọbara mgbali elu na-emecha nwee mgbanwe n'etu ụbụrụ ha dị. ""Ihe ndị dọkịta na-arụrịtaụka maka ya kemgbe bụ ma ilekọta ọbara mgbali elu n'ahụ ndị ntoroobịa ọ na-egbochi mgbanwe ụbụrụ ndị a. ""Ihe ọzọ a ga-emenwu bụ nke anyị na-emekarị ugbua, bụ ichere ruo mgbe onye kataturu obere, ibido na-enyocha ọbara mgbalie elu makana anyị ma na mgbe ahụ, mgbanwe ụbụrụ isi amalitela n'ike n'ike."" Ihe nkiri a ga-amasị gị: Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka" afirika-51831429,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51831429,'Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila (Benue) na Ngbo (Ebonyi) bụ itinye oke-ala'- Onyeisi Ohaukwu LGA,Onye isi ọchịchị Ohaukwu LGA bụ Mazi Clement Odah kwuru na ogbugbu ndị Agila si na Benue gburu ndị Ngbo be ha bụ ihe ịgba anya mmiri.,"“Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila(Benue) na Ngbo(Ebonyi) bụ itinye oke-ala”...Chairman Ohaukwu LGA Odah kwuru na ha agwala ndị National Boundary Commission ka mgbe ọtụtụ afọ ka ha tinye oke-ala ga-eme ka esemokwu ala na ogbugbu mmadụ ahụ dị ka mgbe afọ nari n'etiti Ebonyi na Benue bịa n'isi njedebe. O kwuru na ugbua nani mmadụ itolu nwụnyụrụ anya pii, ma gbakwaa ndị mmadụ ume na igbu mmadụ akwụsịla na Ngbo ugbua. 'Nsogbu ala kpatara ejiri bepụ nne m isi' Eugene Edenyi sị na ndị omekome ahụ gburu nne ya Nsogbu ala ahụ dapụtara n'etiti ndị Ngbo dị n'Ebonyi steeti na Agila dị na Benue steeti ataala isi mmadụ karịrị iri. Ọgbaaghara ahụ malitere n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde abalị iri nke ọnwa Maachị oge ndị Agila kere ekike ọgụ wakpoo ndị Ngbo na atụghị anya, ma gbuo mmadụ itolu pii ebe, ndị ọzọ egbukasịrị mma nọkwa n'ụlọọgwụ dị iche iche n'agbata ọnwụ na ndụ. Mgbe BBC batara n'obodo ahụ, ọ dị ka ebe a gbara ọsọ agha dịka ọgụ na-ada mere ọtụtụ ndị obodo gbaa ọsọ, ebe ndị ọrụ nchekwa juputara ebe ahụ. Otu nwoke bụ Eugene Edenyi ji anyammiri kọọrọ anyị na ya nọ n'ụlọ ya n'Abakaliki bụ isi obodo Ebonyi steeti oge a kpọrọ ya ka ọ gbata na mkpamkpa akpaala na be ha. Maazi Edenyi kwuru na ọ bụ ihe dịka elekere 10:30 nke ụtụtụ, mana tupu ya alọta n'ụlọ ndị mwakpo ahụ egbuola nne ya bepụ ya isi ma burukwa isi ya laa. O kwuru na ụbọchị ahụ ozu mmadụ itoolu ka ha butere ma kwuo na ụfọdụ ndị emerụrụ nnukwu ahụ ka ha na anụzi ozi ugbua na ha anwụọla. Samuel Okpor bụ onyeisi ndị ntorobia na Ngbo Ebonyi steeti. E gbukwara ndị ụmụ nna ya abụọ. Onye so na otu ndị ntorobia na-achịkọta obodo Ngbo bụ Samuel Okpor kọwara na ọ bụ ndị yi uwe ndị agha Nigeria gburu ndị Ngbo. Okpor boro ebubo na ọgụ ala ha na ndị Agila anọla ihe dịka afọ nari nke tagoro isi ihe karịrị nari mmadụ. O ji anya mmiri boo ebubo na ndị agha Naijiria batara na Ngbo izu ụka gara aga sị na ha na achọ ọtụ onye agha navy nke batara na Ngbo mana ahụghịzị ya, ha gwakwara ha na onweghị onye hụrụ nwoke ahụ na Ngbo. Na agbanyeghị asisa ha nyere ha, ndị agha ahụ bụ ndị ha na asị na ha na arụrụ ndị Ajila ọrụ batara ulo ndị mmadụ otu na otu sị na ha chọrọ ihụ ya bụ nwaamadị, ruo ụbọchi tuzde mgbe ndị Agila wakporo ha ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ. Okpor kwara arịrị ma ndị Agila nwere ọtụtụ ụmụ ha n'ọrụ ndị agha, ndị uweojii nakwa 'civil defence', nke mere na ha na-ejikari ndị ọrụ ndịagha na ndị uweojii awakpo ha. E ji ihe gbochie okporoụzọ n'obodo Izzi dị n'Ebonyi 'Aka ndi ọchị ehi adịghị n'okwu a' Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Obianuju Udah sị na mwakpo mere n'okpuru ọchịchị ime obodo Ohaukwu butere ogbugbu mmadụ bu mwakpo sitere n'esemokwu dị n'etiti otu obodoakporo Ngbo na ọzọ akpọrọ Agila dị n'okpuru ọchịchị Ardo na Benue steeti. Ndị uweojii kwuru na onyeisi ndị nche nọ n'Ohaukwu wetara ha mkpesa, mgbe ha ruru, ""ha hụrụ na otu nwoke bụ Fidelis Ali Omem (70) na otu nwaanyi bụ Helen Ali nakwa mmadụ asaa ndị ọzọ nwụnyụru anya n'aka ndị ahụ ebe otu nwoke bụ Titus Ugadu (50) ji ndụ ya gbalahụ ọnwụ ma nọro n'ụlọogwụ ugbua"". Ha hukwara na ndị ajọ mmadụ ahụ gbara otutu ụlọ na ọba ji ndị mmadụ ọkụ. Nwaada Odah sị na esomoku a abụghị ihe ọhụrụ, ma sikwa na agbaghanyeghi ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia, ọ bụghị ndị Fulani na-achị ehi kpara mkpa mkpa. Ọ sịkwa na ọ bụ unyaahụ ka ha nwetere ozi maka ihe mere mana ndị ọrụ ha agaala ebe ahụ maka nchekwa. Odah sị; ""O bụ eziokwu na-egburu mmadụ na mwakpo a mere n'ime abalị. Anyị ga-ewepụta ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ụtụtụ a."" Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti Otu onye mpaghara Ngbo aha ya bụ Uche Ali gwara BBC na ndị kpara mkpa mkpa a yi uwe ndị agha Ọ sị, ""Ọ bụ makana ha yi uwe ndi agha mere ha jiri gafee nwuo ga-ebe anaghịdi azọ ala ka gbusisia mmadụ. Ha che n'ọbụ ndi agha na-abịa, ha amaghị na ọ bụ ndị iro."" Ali sị na iwe dị ndị mmadụ n'obi. Ọ sị, ""Ọ bu ili ndi egburu ka anyị na-eme ugbua. Mana iwe juru ndi mmadụ n'obi."" Onyisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Awosola Awotinde emeela njem nkasiobi ebe ahụ ịga tie ndị ihe ahụ metutere aka n'obi. Awotinde Ji ohere ahụ rịọ ndị mmadụ ha dere juu ma ghara ime ihe ga-eme ka ya bụ okwu kawanye njọ. Ọ si na ya bụ mwakpo bụ ọnwụnwa ịbịa mebie atụmatụ gọọmenti etiti na nke steeti hibere maka ikpezi ya bụ okwu diwara kamgbe. Awotinde nọkwa ebe ahụ kwuo na ndị ọrụ ndị National Boundary Adjustment Commission etinyela 26 Maachi 2020 dịka ụbọchị ha ga-eme njem nchọpụta na Makurdi, Benue steeti. Ọ sị ndị mmadụ ha wepụ anya na asịrị na-efegharị na sochal media bụ nke nwere ike idufu ha ụzọ. Aka na-achi Ebonyi bu Dave Umahi Esemokwu abughi okwu taa Esomokwu dị n'etiti obodo Ngbo na Agila eteela aka. N'afọ 2019, n´ọnwa Mai, egburu mmadụ anọ so na kọmiti gọọmenti Ebonyi na Benue hibere maka ịhụ etu a ga-esi kwụsị esomokwu a. Ndị egburu bu ndị Ngbo na-aga nzukọ kọmiti na Benue. Ihe mere ka o mere izuụka ehibere kọmịti a. Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ N'ọnwa Ọktoba 2019, Osote Onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo kpọrọ aka na-achi steeti Benue bụ Samuel Ortom na Osote aka na-achi Ebonyi bụ Kelechi Igwe nzukọ n'obi gọọmenti n'Abuja ma okwu a. Ndị nwụrụ maka okwu n'afọ 2018 karịrị ise. Onye nnọchịte anya ngalaba na-ahụ maka oke ala Bekee kpọrọ ""National Boundary Commission"" sokwa na nzukọ ahụ Osinbajo kpọrọ. Uche Ali sị na ọ bu eziokwu na okwu eteela, ọ bụ n'afọ gara aga ka ọ malitere ọzọ." afirika-55074814,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55074814,Emmanuel Nwobosi: Ihe ị maghị maka ọchịagha a so Ojukwu kwaa mgbọ n'agha Biafra,"Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ akwaala arịrị maka ọnwụ Emmanuel Nwobosi, ọchịagha kpara ike oge a lụrụ agha Biafra.","Emmanuel Nwobosi bụbu onye fọrọ n'ime ndị so lụọ agha Biafra Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano, bụ otu onye n'ime ha, ọ gara njem iti aka n'obi na be Nwobosi n'ụbọchị Tuzde Novemba ụbọchị 24, 2020. Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ka ọ gara njem iti aka n'obi n'ezinụlọ Nwobosi Nwobosi gbara afọ iri asatọ na abụọ tupu ọ laa mmụọ mana ihe ndị mmadụ ji echeta ya bụ ịhụnanya ike ọ kpara n'oge agha. Ị nụchaa akụkọ Nwobosi, ị ga-ekweta ihe Otiegwu bụ Oliver De Coque kwuru sị: ""A na-enwe obodo enwe, obodo anaghị eko n'elu ka ụgbọgụrụ'. Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu Emmanuel Nwobosi, oge ọ ka bụ okoroọbịa Onye bụ Emmanuel Nwobosi? Emmanuel Nwobosi ka onye agha Nnamdi Kanu na Emmanuel Nwobosi N'afọ 2016, Femi Fani-Kayode, jibu ọkwa Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, dere akụkọ etu Nwobosi si wakpo ụlọ nna ya oge ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na 1966. Fani-Kayode kọkwara etu Nwobosi na ndịagha ya si gbuo Samuel Akintola, onye ji ọkwa 'Premier' nke mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa oge ahụ. O kwuru sị: ""A katọrọ m ihe Nwobosi na ndị agha ya mere n'abalị ahụ. Ana m eru uju nwanne nna m bụ Akintola bụ onye ha gburu n'abalị ahụ."" ""Mana anaghị m ama ya maọbụ ndị otu ya ikpe. Naanị Chukwu ka ikpe dịịrị"". ""Ebughị m ihe ọbụla n'obi megide ha. A hapụla m ha n'aka Chineke."" Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" 50424306,https://www.bbc.com/igbo/50424306,COZA Pastor Vs Busola Dakolo: Lee ihe ụlọikpe kpebiri,"Dịka ụlọikpe kụchapụrụ akwụkwọ Busola Dakolo gbara onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo maka ebubo ịwakpo ya n'ike, Busola ekwuola na ya ga-agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.","Ọkaikpe Othman Musa onye kpere ya bụ ikpe kwuru na e nweghị ihe nọ n'ime ya n'ihi na o teela aka ya bụ ihe mere afọ iri na isii gara aga mere. Dịka akụkọ ahụ pụtara , obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma n'ihi na hụtara ya na ọ ga-eme ka ndị a wakporo n'ike na-atụ egwu kpọpụta onye metọọ ha. End of Twitter post, 1 Ọtụtụ ndị na-akwado ụkọchukwu COZA na-enwe aṅụrị maka mkpebi ahụ. Mana Busola site n'akwụkwọ mgbasaozi ọkaiwu ya bụ Pelumi Olajengbesi binyere aka kwuru na ọkaikpe ahụ elebanyeghị anya n'isi okwu akwụkwọ ahụ ha gbara. O kwuru na-agbanyeghị akụkọ na-eduhie ụzọ nke na-efegharị nke kwuru na aka Fatoyinbo dị ọcha, na nke bụ eziokwu bụ na ""e lebanyebeghị isiokwu anya."" ""Ihe BIODUN FATOYINBO, na-ekwu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya bụ ka ụlọikpe ghara ilebanye anya n'okwu n'ihi na ọ bụ ihe mere oge tereela aka."" ""Ya mere anyị ga-aga n'ụlọikpe dịkarị elu ka ha nyonye anya n'okwu ahụ."" Cheta na ọnwa ole na ole gara aga, Bussola , onye bụ nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo kwụpụtara na mkparịtaụka ya na otu ụlọọrụ ntaaakụkọ nwere na Fatoyinbo wakporo ya oge ọ dị n'obere. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-48985301,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48985301,Anambra flood: Idemmiri achụpụla mmadụ karịrị 2000 n'ụlọ ha n'Anambra state,Idemmiri na-abịa kwa mgbe kwa mgbe n'oge udummiri ebutela nnukwu ihe ọdachi n'Okpoko dị n'Anambara steeti.,"Idemmiri achụpụla ọtụtụ n'ụlọ n' Ọnịcha, Anambara steeti. Ndị bi n'ogige ahụ kọwara etu idemmiri si enye ha nsogbu ma kwuo etu o si chụọ ihe ruru mmadụ puku abụọ (2000) ụkwụ eru ala. Mgbe BBC rutere n'Okpoko, anyị chọpụtara na ebe ndị o metụtara gụnyere Ogbagu, Ede Rd, Amiri St, Ahịa Ojoto, Ezeakunne st Okpoko 1, School rd- Mgbemena nakwa Obodoukwu; ha niile dị n'Okpoko. Otu nwoke idemmiri mebiri ụlọ ya bụ Izuchukwu Ozobi kwara arịrị na ya enweghịzị ebe ya na-arahụ nke o ji enwe ihe ọbụla e ji ebi n'ụlọ o wepụtanwuru n'ụlọ ya. Izuchukwu kwuru na mmiri na-emebi ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ oge niile na-esi na Mgbemena, Awada were na-awụdata n'Okpoko n'ihi na Okpoko nọ na ndịda. Nwaanyi na-azụ ahịa n'Okpoko bụ Ego Kingsley bere akwa, rịọ gọọmentị ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka n'ihi na naani ya na ụmụ ya fọdụrụ n'ụlọ ha mmiri tochiri. Nwaada Ego kwuru na mmadụ niile bi na ya bụ ụlọ agbaala ọsọ mana ya onwe ya enweghị ebe ya ga-agbaga, tinyekwara na idemmiri ahụ mebiri akpa osikapa asaa na ngwaahịa buru ibu ọ na-ere ere. Idemmiri mebichara ihe ndị mmadụ ji ebi n'ụlọ ma chụpụ ha n'ụlọ ha Ndị ọzọ bikwa n'Okpoko ji obi mwute wee na-akọwa na ibi ndụ n'ime Okpoko bụ ịchị obi n'aka. Ndị na-azụ ahịa na ndị ọkwọụgbọala na Keke kwuru na ogbe ha dị ka nke ndị gọọmentị Anambara steeti chefuru echefu. Ọtụtụ bi n'ime Okpoko nke dị n'ogige Ọnịcha na-agazị na be ndị enyi na ikwu na ibe ha arahụ n'ihi na idemmiri emebisiala ụlọ ha. Lee ihe nkiri gbasara etu idemmiri si chụọ ndị mmadụ n'ụlọ ha n'afọ 2018: Lee ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu. Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." afirika-49480481,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49480481,Minimum wage: Lee mgbe anyị ga-ebido kwụwa ndị ọrụ anyị,"Ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ nke bụ puku naịra iri atọ (N30,000), ka na-apụta okwu.","Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ Ndị otu jikọrọ ndị ọrụ Naijiria bụ ""Nigeria Labour Congress"" nọ n'ọgbakọ ha Ụbọchị Monde baa mba ma dọọ gọọmenti aka na ntị ka a malite kwụwa ha opekatampe ọhụrụ ahụ. N'aka nke ọzọ, akụkọ kọkwara na gọọmenti Kaduna Steeti ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ n'ọnwa Septemba. Mana ndị gọọmentị Ọwụwa Anyanwụ kwuru na ha ga-amalite ịkwụ ụgwọ a mgbe ọbụla gọọmentị etiti bidoro ịkwụ ya. Dịka C-Don Adinuba, kọmịshọna mgbasa ozi na Anambra State, siri kwuo, Gọvanọ Willie Obiano kwetara na ọ ga-akwụ ụgwọ ahụ. C-Don Adinuba, Kọmishọna mgbasa ozi n'Anambara Steeti. Mana ọ ga-abụ ma gọọmentị etiti na ndị NLC kwekọrịtachaa. ""Gọọmentị etiti ewepụtabeghi usoro a ga-eji kwụọ ya bụ ụgwọ."" ""A ka na-eme nkwekọrịta ahụ n'Abuja."" ""I kwụọ onye ""level 1"" puku naira iri atọ, ego ole ka ị ga-akwụ onye 'level 2' na 'level 3'? ""Mgbe ọbụla e wepụtara nkwekọrịta, anyị ga-amalite kwụwa."" Emma Uzo, onyeisi ntaakụkọ nke gọvanọ Dave Umahi Emmanuel Uzo, onyeisi mgbasa ozi nke Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi, kwukwara otu ihe ahụ. ""O nweghị mgbe gọvanọ Ebonyi ji kwuo na ọ gaghị akwụ. ""Kama nwata agaghị ebu nna ya ụzọ mụta diọkpara."" ""Anyị na-eche ka gọọmentị etiti bido kwụwa tupu anyị ebido."" Uzo kwukwara na gọọmenti kwesịrị ibuli ego a na-enye steeti ọbụla kwa ọnwa. Nke ahụ ga-enye aka ma a malite ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ a. Ndị ọrụ NLC na-eme ngagharịiwe. Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye ma mgbe ndị ọrụ n'ala Igbo ga-esoro ibe ha rachawa pịọm. Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari enyere iwu ka e bido ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị etiti ụgwọ opekatampe ọhụrụ. Mana nke ahụ metụtara naanị ndị ụgwọ ọnwa ha erubughi puku naịra iri atọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe nkiri ga-amasị gị: Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba." egwuregwu-53506558,https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-53506558,Liverpool vs Chelsea: A gbaala Chelsea ọtọ ka ụwa hụ,"Liverpool mere Chelsea ""pọọ pịị - yes"" mgbe ha zutere n'ọgbọegwuregwu Anfield.","E nyere goolu asatọ na ya bụ egwuregwu, nke Chelsea ketara naanị atọ n'ime ya. Liverpool gosiri ihe ha ji bụrụ ndị mmeri dịka ha nyegidere goolu a rịọwazie ha biko. Naby Keita bu ụzọ nye goolu na nkeji 23, Trent Alexander-Arnold nyere nke abụọ na nkeji 38, tupu Georginio Wijnaldum atụkwasị ya nke atọ na nkeji 43. Ọ bịara dị ka Chelsea otetala n'ụra mgbe Olivier Giroud gbakanyere goolu mbụ ndị Chelsea na nkeji 45, tupu a gaa ezumike nkeji 15. Roberto Firmino mezuru ya anọ na nkeji 55, tupu Chelsea abịa wepụ Willian, Giroud na Mason Mount. Mwebata e webatara Tammy Abraham na Christian Pulisic bịara mịta mkpụrụ dịka ha abụọ nyere goolu na nkeji 61 na 73, mana Liverpool ekweghi ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Chelsea gbara elu, gbaa ala, mana isi ha apụtaghị. Alex Oxlade-Chamberlain gbanyere goolu nke ise dịka ha pụchara bọọlụ gbapụ ọsọ ka Chelsea gbachara ""free kick"" n'ihu poostu ha. Liverpool na onwe ha anatala iko Premier League ha butere, ebe Chelsea na onwe ha agbadaala n'ogogo anọ dịka Manchester United ji goolu ole ha nyere, aga ha. Liverpool metụrụ iko Premier League aka dịka ọ bụ mbụ ha na-ebuli ya n'ime afọ 30 Chelsea ga-ezute Wolves ebe Manchester United na Leicester City ga-ezute n'egwuregwu ikpeazụ, tupu a kaa okwu ọnụ. Liverpool na onwe ha ga-ezute Newcastle United." afirika-49798240,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49798240,Ghana si na ha anwụchiela ndị chọrọ ichutu Onyeisiala Akufo-Addo n'ọkwa,Ndị ọrụ nchekwa na Ghana akọọla etu ha sị gbochie ndị ha si chọrọ ịnapụ ikike n'aka na-achi mba ahụ bụ Nana Akufo-Addo.,"Ndị ọrụ nchekwa a banyere ọrụ n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Fraịde gara aga ma nwụchịkọ ndi a ha na-enyo bụ ndị ha sị na ha na-akpa nkata ịchụtu onyeisiala Ghana ma nọchịe anya ya. Dịka akwụkwọ mgbasaozi ụlọ ọrụ Mgbasa Ozi wepụtara kwuru, ndị ọrụ nchekwa rụrụ ọrụ ha nke gunyere ime nyocha ma chopụta nke bụ eziokwu tupu amalite nwụchịkọ ndị a. ""Njem a ndị ọrụ nchekwa di iche iche tinyere aka na ya pịnyụrụ, nkata akpara iji chupu onyeisiala, bụ nke kaara itinye mba Ghana na ọgbaghara. "" Ọ bụ Maazị Kojo Oppong Nkrumah binyere aka n'akwukwọ mgbasaozi a. Ndị a aka ji bụ Dọkịnta Frederick Yao Mac-Palm, onye ọkpụ egbe aha ya bụ Ezor Kafui na Bright Allan Debrah Ofosu. Ụlọ ọrụ mgbasaozi sị ""n'etiti ọnwa Juun na Ọgọọst nke afọ 2018, BB, bụ onye na-agara Dọkinta Mac-Palm ozi, gakwuru ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa ka ha soro kpa nkata ichutu gọọment were ọnọdụ."" akụrụmgwa agha ndị nchekwa natara ndị a na-akpa nkata E kwuru na ndị a mere nzukọ na nuzo na ebe akpọrọ Next Door Beach ma nwaa akụrụmgwa ha chọrọ iji mezuo ebumnuche ha na gburugburu Laboma Beach. Ngwaagha a ndi ọrụ nchekwa natara ha gunyere egbe nkenke akpụrakpụ na ọbọ mgbo ya, egbe nke emere n'ofesi na ọbọ mgbo abụọ, ihe na akwụ anụrụ ọkụ atọ nakwa mma. Ka akụkọ na foto ndị kpara nkata nakwa akụrụmgwa ha ruru soshal midia, ụfọdụ mmadu malitere ịjụ ma gọọment okwukwara nke bụ eziokwu maka nkata a ha si na ndị a kpara. Ndi ọzọ na-aju maka akụrụmgwa ndị egosiri o zuru ibuso ndị agha Ghana agha." afirika-49111268,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49111268,Leah Sharibu: Anyị na-enwe mkparịtaụka ịzọpụta ya na ndị ọzọ a tọọrọ - Gọọmentị etiti,Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha amalitela mkprịtaụka n'isi ndị a tọọrọ n'ugwu Naịjirịa nakwa Leah Sharibu.,"Nke a na-eme dịka aha Leah wuru ewu na soshal midia ụbọchị Tọzde dịka a na-ebo ebubo na ọ nwụọla n'ihe onyonyo Boko Haram ziputere. Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru n'ime ozi o zipụtere site n'akara Twitter ya, na gọọmenti n- ndị na-echere ozi ka na-kparịta etu a ga esi kpọpụta Leah and ndị ọzọ Boko Haram. End of Twitter post, 1 N'otu aka ahụ, Nna mụrụ Leah Sharibu ekwuola na o nwebeghi ihe ọ nụrụ maka nwa ya nwaanyị na nsonso a. Mgbe BBC kpọtụrụ ya n'ekwentị, ọ kọwara na ịkpeazụ ya na onyeisiala kpakọrịtara bụ afọ gara aga. ""Ọ bụ sọsọ ndị otu okpukpere m na ndị otu alakụba na-akasi m obi gbasara Leah"" ka o kwuru. Cheta na otu ihe onyonyo ahụ pụtara na-egosi mmadụ isii ndị ọrụ enyemaka ka ha na-arịọ gọọmentị ka enyemaka ịgbapụta ha n'aka ndị Boko Haram na mpaghara Ugwu Naịjirịa. N'ime ihe onyonyo ahụ, otu nwaanyị na-ekwu na a wakporo ha, kpọro ha gawa ebe ha amaghị. Ndị ọrụ enyemaka a kpọrọ Action Against Hunger sị na mmadụ isii nọ n'ime ihe onyonyo ahụ bụ ndị ọrụ ha. Otu n'ime ndị ọru enyemaka ahụ kpọro onwe ya, Grace yi uwe ndị ofufe Alakuba, ebe ụmụnwoke ise a na-eche na ha bu ya na-aha na-arụkọ ọrụ gbara ya okiri kiri. Nwaanyị a kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa na ndị mba ofesi mee ngwa ngwa gbapụta ha. Na mbido izu a, Action Against Hunger zipurụ akwụkwọ mgbasaozi sị na a wakporo otu ụgbọala ha n'ụzọ Damasak. Nne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro Ha kwuru na otu n'ime ndị na-akwọrọ ha ụgbọala nwụrụ ebe ndi otu ha ndị ọzọ na-efu efu. A na-eche na aka Boko Haram na Islamic State of West Africa Province (ISWAP) dị na mwakpo a na-eme n' Ugwu Naịjirịa. Ndị agha Naịjirịa na-ekwu na ha emekpaala otu ndị a ahụ mana ha ka na-akpa ike dị egwu na mpaghara ahụ. Akụkọ ga amasị gị: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?" afirika-44191716,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44191716,Ị ma ihe ole na ole e ji ama ofe ndị Igbo?,"N'ajụghị ajụjụ, e nwere ihe ndị ọ ga-abụ ị hụ n'usekwu onye Igbo, ị mara na ọ na-akwado isi ofe?","N'ala Igbo, ụfọdụ na-ahụ eju n'ọkụ, e nwekwara ike isi ya esi maọbụ ghee ya eghe Ebe ụfọdụ ndị agbụrụ ndị ọzọ ọkachasị ndị Yoruba, amụtaghị etu e si etinye 'ngwa ofe dị icheiche', bụ ihe ndị na-atụ ndụ mmanụ, onye Igbo amụtaghị etu e si esi ofe ghara itinyeju ya ihe ndị 'na-anọchi ụzọ'. Ndị si n'akụkụ Kalaba nakwa Akwa Ibom, makwa etu e si etinyeju ihe n'ofe dịka ndị Igbo, nke nwere ike ịgbawoju onye na-amaghị etu e si ahọpụta nri anya. BBC Igbo ga-egosi gị ihe ndị e ji ama ofe ndị Igbo. 1) Okporoko Okporoko so n'ihe ndị Igbo ejighi egwu egwu ọkachasị abịa n'isi ofe. Onye Igbo enweghị ike isi ofe na-etinyeghị okporoko, nke mere na ndị ahịa na-ere ya n'ibe n'ibe dịka isi ya, ọdụ ya nakwa etiti maọbụ nke akwọrisiri akwọrisi. Okporoko na-enwe isi nke ya na-eto mmadụ akpịrị. Ụfọdụ na-agwọ ya agwọ ma taa ya na ụgba maọbụ abacha. Okporoko batara Igbo ọfụma mgbe a na-anụ agha Biafra. 2) Ịsam Ụfọdụ na-aghụpụta ya n'okpokoro ya tupu e jiri ya sie ofe Dịka ndị Igbo, ịsam na-amasị ndị mbammiri dịka ndị Rivas, Krọss Riva nakwa ndị Delta. Ọ na-amasị ụfọdụ ịghụpụta ya n'okpokoro ya tupu e sie, ebe ndị ọzọ na-esi ya na okpokoro ya ma mịpụta ya ma ha na-esuru ofe. 3) Ede E nwere ọtụtụ ofe ede na-amasị ndị Igbo Abịa n'ala Igbo, naanị mkpụrụ ofe ole na ole bụ ndị anaghị eji ede esi. Ọtụtụ ofe dịka ofe ọha, ofe onugbu, ofe ụgụ, na ndị ọzọ ga-enwerịrị ede maọbụ ji maọbụ achị maka ime ụrị (ya bụ ime ka ọ kpụkọta ọnụ). 4) Akwụkwọ nri Ofe ndị Igbo niile na-enwe akwụkwọ nri Ndị Igbo anaghị eji akwụkwọ nri dị iche iche egwu egwu ọkachasị ma ha na-esi ofe. Ụfọdụ oge, ha na-eji ihe karịrị otu ụdịrị akwụkwọ nri esi otu ofe. Ofe ndị dịka 'ofe Owere' na-enwe ọkazị nakwa ụzịza Ihe akwụkwọ nri ji dị mkpa n'ala Igbo bụ na ọ bụ ya na-enye ofe aha. Ị gaghị akpọ aha ofe na-akpọghị aha akwụkwọ nri ị tinyere ya. Ọmụmaatụ bụ 'ofe ọha', 'ofe onugbu', 'ofe ụgụ', 'ofe ọkazị' na 'ofe ụzịza'. 5) Akwụ Ọ na-amasị ụfọdụ ịzụta mmanụ nri kama iji mkpụrụ akwụ Ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu na isi akwụ ma were mmiri na mmanụ ị sụpụtara na ya sie ofe na-aka ụtọ karịa nke e ji mmanụ sie. Nkọwa ha bụ na mmanụ a na-ere n'ahịa agabigala ọtụtụ usoro na-ewepụ ụtọ ya na ihe ọ na-enye n'ahụ. 6) Ero A na-efote ero n'ala ọkachasị oge udummiri Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị Igbo niile ka ero na-amasị, mana ọ na-amasị ma ụtọ ya na uru ọ bara. Ero nwere ụdị na ụdị, ma nke a na-akpọ 'atakata eloo' ma nke a na-akpọ 'ero mgbawa' maka na n'agbanyeghị awa ole ị siri ya, ọ gaghị edecha ede. 7) Ogiri E nwere ụdịrị ogiri dị icheiche Ị ma aha ihe ahụ na-esi ma ị tinye imi n'usekwu nwaanyị na-esi ofe ọha? Aha ya bụ Ogiri. Ogiri nwere ụdị na ụdị, nke a na-akpọ 'ogiri okpei' nke bụ nke a dị na foto a dị n'elu, nakwa nke a na-eke n'akwụkwọ (ogiri Igbo) bụ nke a na-eji esi ofe nakwa agwọ abacha. Ndị ọzọ bụ 'ogiri ụgba', 'ogiri egwusi'. 8) Eju Eju na-agbọnyụsị ọkụ ma a na-esi ya Ụfọdụ ezinaụlọ na-ewe eju nke e ji 'Congo meat' mara dịka ihe ọpụrụiche. Ọ bụghị 'anụ' a na-ahụkarị oge ọbụla maka na ọ na-apụtakarị n'oge udummiri, nke mere na a hụ ya ahụ, ọ bụrụ ihe a na-eri ka ọ bụ emume ruo oge ọkọchị ga-eme ka ọ laa. Tupu e tinye eju n'ofe, ụfọdụ na-aghụ ya n'ọkụ maọbụ ghee ya eghe maọbụ sie ya n'ite mmiri ọkụ. 9) Ịsha N'ezie, ndị obodo ndị ọzọ na-ejikwa ịsha esi nri Ọ bụghị naanị ofe ka a na-eji ịsha esi. Mana ọ bụ ihe ndị Igbo anaghị echefu itinye n'ofe. Ịsha na-enye nri ụtọ pụrụiche. 10) Azụ ọkpọọ A na-ejikwa azụ ọkpọọ esi osikapa eji mmanụ nri sie nke a na-akpọ 'local rice' na bekee A na-ere azụ ọkpọọ n'ibe n'ibe dịka okporoko. Azụ ọkpọọ nwere ụdị na ụdị, na-enye ụtọ dị iche iche na nri. E nwere nke a na-akpọ 'azụ asa', 'azụ isi', 'azụ bọnga' 'azụ mangala', 'azụ kpachaa' nakwa 'kpanla' Mụtakwa etu e si esi ofe nsala ebe a. I ma etu esi esi ofe nsala?" afirika-44085354,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44085354,Onye odee akwụkwọ ndi otu CAN awụọla,Onye bụ ode akwụkwọ ndị otu Christian Association of Nigeria (CAN) bụ Musa Asake anwuola.,"Amabeghị ihe gbụrụ ya, mana akụkọ anyi na eso na-akọwa na ọ nwụrụ n'ụtụtu tata n'Abuja. Ọ rịara ọrịa, bụ ihe a na-ele anya bu ihe butere ọnwụ ya. Ihe a bụ izuụka abụọ Maazị Asake nọ n'isi ndị CAN gara ngagharị iwe make ogbugbu ha na-ebo ndi Fulani na-achị ehi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Musa Asake bụ onye Kaduna steetị, ma bụrụ onye ọnu na-eru n'okwu banyere ihe metụtara ndi uka na ndi ndida Kaduna steeti. Akuko banyere ihe a ka na-abịa." 44861730,https://www.bbc.com/igbo/44861730,Anyị dọpụtara ụfọdụ mmadụ ebe ụlọ ha dagidere ha- Waziri,Mmadụ ruru iri anọ na itoolu nwụrụ na Jibiya dị na Katsina steeti ụnyaahụ bụ Monde ka oke idemmiri wakporo ha.,"Oke idemmiri ahụ nke so mmiri ozuzu kwadakwara ụlọ ebe obibi ruru narị ise. Akụkọ kwuru na oke mmiri ozuzo mere na mmiri dị nobodo ahụ tofee ikpere mmiri ma wakpo ndị obodo ahụ. Onyeisi ụlọọrụ gbatagbata gọọmenti a kpọrọ Katsina state emergency management agency bụ Aminu Waziri gwara ụlọrụ ntakụkọ AFP na ha ahụla ozu mmadụ 49. Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akasiela ndị ọdachi dakwasiri obi. O kwuru na ya enyela ụlọọrụ gbatagbata NEMA iwu ịgbatara ndị ihe metụtara ọsọ enyemaka. O siri: "" Dịka ọrụ ịgbapụta ndị ihe mere na-aga n'ihu, ezinaụlọ, gọọmenti na ndị Naịjirịa na-eti ụnụ aka n'obi.""" afirika-44115495,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44115495,Ndị Naijiria akpọọla oku ka a tọpụ Leah Sharibu,"Taa Monde, ụbọchị 14 nke ọnwa Mee 14 ka Leah Sharibu gbara afọ iri na ise (15)","N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 101 ghara Leah Sharibu Ọtụtụ otu na ndị Naijiria akpọrọ oku ka aka ji nwata Dapchi ahụ hapụ ya. Leah, onye nọrọ abalị iri asatọ na atọ n'aka ndị Boko Haram so n'ime ụmụakwụkwọ Dapchi otu narị na iri (110) ndị Boko Haram tọrọ na ọnwa Februwarị afọ a. A tọpụrụ ndị ọzọ ma kpachie nwata ahụ n'ihi na ọ jụrụ ịgọnahụ Kraistị. N'ihe nkiri na-efegharị na soshal midia, nna Leah bụ Nathan Sharibu bekuru Gọọmenti etiti ka ha gbalia hụ na nwa ya nwaanyị nwere onwe ya. End of Twitter post, 1 Ọtụtụ otu jikwa ncheta ọmụmụ Leah were kpọọ oku n'igwe okwu Twitter ka a tọrapụ ya. Otu jikọrọ ndị otu Kraist mbaụwa a kpọrọ, Christian Solidarity Worldwide (CSW), amalite ime ka ọha nụrụ olu ha na soshal midia dịka ha na-eti mkpu ka a tọhapụ Leah Sharibu. Ebe ndị ọzọ jikwa oge a were kpere nwata ahụ ekpere ka Chineke gbapụta ya. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45812364,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45812364,NLC sị na ha anabataghị ụgwọ ọnwa opekatampe puku naira iri abụọ na anọ,otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa na-akọwa na ha achọghị puku naira iri abụọ dịka opekatampe ụgwọ ọnwa ndị ọrụ na Naịjirịa.,"Minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige bụ onye tupuru azụ na Wenesde bụ ubọchi nke iri nke ọnwa Ọktoba 2018 sị na gọọmentị kwụrụ na ya ga enye ndị ọrụ gọọmentị etiti puku naira iri abụo na anọ, ebe ndị steeti ga-eri puku naira iri abụọ. Mkpebi a bịara ka ndị ọrụ mechara arụkwaghịm nke ha sị ha ji dọọ gọọmentị aka na ntị. Nasir Kabir, bụ onye ode akwụkwọ Nigerian Labour Congress (NLC), gwara BBC na ha na gọọmenti nwere mkparịta ụka maka ụgwọ ọnwa opekatampe, mana na ha ekwekọrịtabeghị. Ọ sị na aha ego a gọọmentị na-akpọ bu ihe egwuregwu. O kwukwara na ha agaghi ịnabata ego ole ahụ, makana ha gwara gọọmenti ebumnuche ha. Kabir kwukwara na ọbụrụ na gọọmentị emezughi ihe ha chọrọ, ha ga alagachi na-abụbụ ọrụ. Kabir sị, ""Gọọmentị kwesiri ịma na bụrụ na enweghị onye ọrụ, enweghị gọọmentị, nke mere ndi ọrụ jiri dịrị gọọmentị nkpa."" Mazi Kabir sị na ego ole ha na gọọmenti kpara bụ puku naria iri atọ, bụ nke gọmentị ekwetabeghị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49868994,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49868994,Illegal maternity centres: Ndị uweojii azọpụtala ụmụnwanyị 19 e ji eji n'ụlọ nzuzo ebe a na-ere ụmụaka,Ndị uweojii na Legọs Steeti azọpụtala ụmụnwanyị iri na itoolu bụ ndị e ji eji n'ime ụlọ nzuzo ebe a na-ere ma na-azụkwa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ.,"Akụkọ dị mkpa: Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV si deputa, ụlọ nzuzo ahụ dị na mpaghara Ikotun nke dị na Legọs. Ụmụnwanyị iri na itoolu ahụ azọpụtara dịcha ime. Onye kacha dị nta n'ime ha gbara afọ iri na atọ (13) ebe onye kacha bụrụ okenye dị afọ iri abụọ na asatọ (28). Ndị uweojii zọpụtakwara otu nwa ọhụrụ a mụrụ naanị otu ụbọchi gara aga. Ha nwụchikwara ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọ nzuzo. Mana onye nwe ya bụ ụlọ aha ya bụ 'Madam Oluchi' bu onye ndị uweojii sị na a ka na-achọ achọ ugbua. Stanley Nwabia alaala mmụọ Oke ọdachi dakwasara Igbo taa. Ọnwu egbujọọla ọzọ Nwaafọ Igbo a ma ama n'ọbaozi Twitter bụ Stanley Nwabia alaala mmụọ. Nwabịa gbara afọ iri anọ na atọ. Ọ nwụrụ n'ụtụtụ Sọnde n'ụlọgwụ dị na Legọs. Ọnwụ ya bịara ndị mmadụ na mberede n'ihi na abalị atọ gara aga ka o si n'akara 'Twitter' ya zipu ozi. Ọtụtụ ndị nwere agba na Naịjirịa dịka Atiku Abụbakar nakwa otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' kwuru na ọnwụ Stanley wutere ha. Nne Siasia enwerela onwe ya N'ụbọchị ole na ole gara aga, Siasia nọ na-arịọ ka ndị ntọrị a hapụ nne ya. Ndị ntọrị atọhapụla nne Samson Siasia onye bụbu onye nchịkọta otu Super Eagles dịka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa abụọ n'aka ha. Ekwerikumo Siasia bụ onye ezinaụlọ ha gwara BBC na ndị a tọhapụrụ nwaada Ogere Beauty Siasia n'ime abalị Satọde 28 Seputemba, 2019. Ọ sị na ha tọhapụrụ ụmụnwaanyị abụọ ndị ọzọ a tọọrọ ya na ha. Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-atọrọ nne Siasia, nke mbụ bụ n'afọ 2015. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bayelsa Steeti bụ Butswat Asimin sị na nke a bụ eziokwu, na ha na-aga n'ụlọ ha ị mata ka 'eke si anya anwụ'. Cheta na ndị ntọrị tọọrọ nne Siasia n'ụbọchị 15 Julaị, 2019 n'obodo ha bụ Odoni, okpuruọchịchị Sagbama dị na Bayelsa Steeti. Ọgwụ obi nwere ibute ọrịa kansa Ọgwụ na-akwụsị obi ịcha ọkụ Ụlọọrụ na-ere ọgwụ akpọrọ CVS dị na Amerika esorola ndị ọzọ machiri ire ọgwụ achaobi nke Bekee kpọrọ 'Heartburn'. A na-atụ egwụ na ọgwụ a nwere ike ibute ọrịa kansa. Mba Canada na Fransị amaala ọkwa ka ndị niile goro ya bụ ọgwụ weghachite ya azụ. Buhari agbarụọla ihe na njide ụmụnwoke na Kaduna Onyeisiala Naịjirịa kwuru na ọ bụ arụ ka nne na nna gbajọọ itinye nwa ha n'ụlọakwụkwọ n'oge a Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla njide na mmekpa ahụ e mere ụmụaka na ụmụnwoke ruru narị ise n'otu ụlọ dị na Rigasa, Kaduna Steeti. N'ozi si n'aka onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu pụta, Buhari sị na a kọwara ụlọ ahụ dịka ebe ịtụ mgbere mmadụ. Onyeisiala jikwa ohere a kwuo na ụmụaka niile nọ ebe ọbụla kwesiri inwe ezi nchekwa ka ha ghara idabanye n'ihe ọjọ ọbụka na-ame n'obodo ebe ha nọ. N'okwu ya, "" Ọ bụ nnukwu arụ ka ndị nne na nna ọbụla gbajọọ ikpọga nwa ya ụlọakwụkwọ n'oge a."" Cheta na ndị uweojii zọpụtara mmadụ ruru narị atọ gụnyere ụmụnwoke na ụmụaka n'ụlọ ebe ekere ha agbụ kamgbe ọnwa iri atọ na Kaduna. Ikpochapụ unyi n'Abia na Imo Steeti Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Iji mee ka oke unyi dị n'Abia Steeti kwụsị gọvanọ Okezie Ikpeazụ enyela onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mkpofu unyi bụ Okechukwu Apugo ọsọ. N'otu aka ahụ gọọmentị Imo steeti amachiela ndị mmadụ iji akpa wakịrị wakịrị ekpofu unyi na Steeti ahụ. N'ofesi Ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ dịka igwe na-agba okirikiri bụ roller coaster na bekee kwọpụrụ n'okporo ya n'obodo Mezico. Anya hụrụ ka o si mee kwuru na ndị a si n'elu elu igwe ahụ dị n'ama mkpori ndụ La Feria Chapultepec daa. N'egwuregwu Coleman eturula ugo Christian Coleman Christian Coleman nke mba Amerịka eturula ugo na asọmpị igba ọsọ nke mita narị n'egwuregwu World Athletics Championship nke na-aga n'ihu ugbua n'obodo Doha, Qatar. Naanị tịnkọm tịnkọm itoolu na ụma asaa ka o were Coleman iji nweta mmeri a. Justin Gatlin bụkwa onye Amerịka gbara onye nke abụọ na ya bụ asọmpi. Andre De Grasse onye Kanada gbara onye nke atọ. N'asọmpi Premier Manchester City ji ọkpụ atọ asatara otu merie Everton iji na-ahụ azụ Liverpool anya. Ebe Atletico Madrid na Real Madrid enweghi onye meriri ibe n'asọmpi nke La Liga. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-44079283,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079283,Ntuliaka 2019: Pati ADC ọ ga-emegwara APC ihe ha mere PDP?,"N'afọ 2013, otu pati anọ na Naịjirịa kpokoro ọnụ mee otu pati iji kwatuo patị PDP bụ ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ.","Pati APC na mbụ na ndụ Naịjirịa kamgbe ndị nkịtị were ọchịchị n'afọ 1999 napụrụ onyeisiala nọ n'ọchịchị ọkwa dịka ha meriri na ntuliaka 2015. Oge ahụ ka Muhammadu Buhari nara Goodluck Jonathan ọchịchị. Pati ndị mere APC Pati anọ bụ ndị mebere otu pati APC n'afọ 2013. Pati ndị ahụ bụ ndị chere na ihe onyeisiala Jonathan na-eme oge ahụadighi ha mma. Pati ndị ahụ bụ: N'ọnwa Novemba afọ 2013, gọvanọ ise nọ na PDP hapụrụ pati ahụ banye APC ebe ndị sinetọ ruru mmadụ 49 mekwara etu ahụ nke mere APC jiri merie ọchịchị n'afọ 2015. PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị Nke na-eme ugbua Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo dọkara akwụkwọ kaadị gosiri na ọ bụ onye otu pati PDP kwuo na ya anọghịzi n'otu pati ọbụla. N'ọnwa Jenuwarị afọ a, Obasanjo bidoro otu ọhụrụ nke ọ kpọrọ Coalition for Nigeria Movement CNM n'aha ịchafụ nke o kwuru na ọ bụghị otu pati mana ụnyaahụ, otu ahụ kwupụtara nkwado ha nye otu pati ADC maka ntuliaka 2019. APC were ọchịchị n'afọ 2015 Pati ADC a ọ chọrọ ime ihe APC mere na 2013? APC bụ pati kpokoro pati ndị we merie ọchịchị ma Obasanjo kwuru na ha chọrọ inye ndị APC ọsọ, nke pụtara na ha nwereike ikwatu APC etu APC si kwatuo PDP. Ụfọdụ ndị gọvanọ nọ n'APC na ekwupụta iwe ha gbasara ọchịchị ndị APC ebe ụfọdụ ndị omeiwu dịka onyeisi ndị sineti na ndị pati APC na-akwata ya kamgbe. Ọ bụrụ na ndị a iwe na-ewe kpebie ịpụ na APC, ha nwereike laghachi PDP maọbụ banye pati ọhụrụ ahụ ebe Obasanjo nọ nke ga-enye ADC ụdị ikike APC nwere oge nke ya. Ihe ndị ị na-amaghị maka CNM na pati ADC Ha ji ụdị ihe osise a na-ajụ ụmụ Naịjirịa ajụjụ gbasara etu ngalaba dị icheiche na Naịjirịa si eme Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'APC bụ Bolaji Abdullahi kwuru na-agbanyeghi na CNM na ADC kpokoro, ya mara na ụmụ Naịjirịa ka nwere ntụkwasị obi n'otu ya APC. Ihe a niile na-eme na-egosi etu ntuliaka 2019 ga-esi gaa na ihe ihuigwe ga-adị ka ya oge ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-55647019,https://www.bbc.com/igbo/afirika-55647019,Stingy Men Association na njirimara ha,Stingy Men Association of Nigeria enwurula ọkụ kamgbe ndị ama ama tinyere ọnụ n'okwu a.,"Ndị dịka oti egwu Don Jazzy ezigbo aha ya bụ Michael Collins Ajereh sonyere okwu a dịka onye ndu otu ahụ. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ bido jụwa ma ya bụ okwu abụ ezie ka ọbụ ihe egwuregwu. Kedụ ka o si malite? Atụmaatụ 'Stingy Men Association' a bidoro mbụ wuwe na Zambia ebe ụmụnwoke mba ahụ kwuru na ha agaghị atụnye ego gafere k5 n'ego Zambia n'isi ndị ọyị ha nwaanyị kama ha ewere ego ahụ chụta ego ga-abara ha uru. Ihe ikwesiri ịma maka 'Stingy Men Association of Nigeria' Atụmaatụ a bụ nke ụmụnwoke Niaịjirịa wepụtara na-ewu na soshal midia , iji kparị ọchị n'etiti ndị ji soshal midia ezi ozi. N'ime akwụkwọ ndenye aha ha wepụtara, ha depụtara iwu otu ahụ bụ ikwalite ugwu ha site n'igbajọ inye ụmụnwaanyị ego na nkịtị. Ha kwuru na ha agaghị etinye ego n'obi n'ọyị ha na-ayịsa ụmụnwaanyị. Ndị ama ama sonyere n'atụmaatụ a Na twitter , Don Jazzy wepụtara foto akwụkwọ njirimara ya a kpọrọ 'Id card' na bekee ma dee 'Emezuola m ndenye aha.' Otiegwu Naịjirịa, Paul Okoye a.k.a Rude Boy sonyere otu a dịka o wepụtara id dịka onye otu ahụ nwa mgbe nta. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na soshal midia nakwa ụfọdụ ụmụnwoke na Naịjirịa egosila mmasị ha isonye na ya bụ otu na-achọghị imefu ego ọbụla n'isi nwaanyị ọbụla ha na-ayị. Ihe ha dere n'okpuru akara njirimara ha bụ enyekwa shi shi( enyekwela ego ọbụla). A mabeghị ihe butere ọwuwu atụmaatụ a mana o butela mkparịtaụka n'etiti ụmụ nwoke Naịjirịa gbasara emefughị ego n'isi ndị ọyị nwaanyị. [Stingy Women Association of Nigeria] SWAN Ụmụnwaanyị Naịjirịa abanyela soshal midia ibọ ọbọ site n'ihibe otu a kpọrọ Stingy Women Association. Ọ bụ eziokwu na owuwechabeghị ọfụma nke otu ahụ mana anyị ahụla esereese ndị a nakwa ụfọdụ ndị na-asa ha okwu na soshal midia. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:" afirika-47708406,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47708406,Nurse murder: Ndị ọrụ 'Psychia' n'Enugwu akwaala arịrị maka ọnwụ onye otu ha,Ụlọọgwụ Psychiatric Enugwu nọ n' iru uju ugbua maka ọnwụ Maria Amadi bụ onye isi ngalaba ndị nurse na ya bụ ụlọọgwụ.,"Njinji ahụ jiri n'izu ụka gara aga oge ojiegbe egbu gbaturu nwaanyị ahụ ka ọ latara n'ụlọ ya. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Ebere Amaraizu kọwara na ka ya bụ nwaanyị lọtara n'ụlọ ya, gbapee ụzọama ya ka ndị ahụ na-echebu ya jiri gbaa ya egbe. E buru ya gawa ụlọọgwu Parklane Enugwu, ebe ahụ ka ọ nọ kubie. Kọmishọna ndị Uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kwuru na aka akparala mmadụ abụo e chere na ha so gbuo nwaanyị ahụ. Balarabe yọrọ ndị mmadụ ka ha dere jụụ ma zitere ndị uweojii ozi ihe ha na-enyo enyo na gburu gburu ha. Ọnwụ Amadi bịara dịka ya na ndị isi ọrụ ha ndị ọzọ kụkọchara isi gbasara ụmụakwụkwọ ndị si 'School of Nursing' were pụta bụ nke Maria sị na ha agaghị arụ ọrụ na 'Psychịa' maka na ha etozughị etozu. Maria bụ onye isi ndị Nursing services bụ ndị ọdị n'aka ịhụ maka ịleta ndị ejighị ahụ n'ụlọọgwụ ahụ. Ndị ọrụ na Federala Psychiatric Hospital na-achọghị ka akpọ aha BBC igbo sị na ihe ha jiri mara Amadị bụ ""Madam Integrity"" nke bụ na ọ naghị etinye aka maọbụ kwado ihe nrụrụaka ọbụla. Ha kwuru na ihe mere Maria ji ju iwe ụmụakwụkwọ ndị ahụ 'School of Nursing' zụpụtara bụ maka na gọọmentị napụrụ ha ikike ịzụ nd ị nọọsụ maka na ha ezughị ezu na nkụzị akwụkwọ ụmụ nọọsụ. Dịka ka ha sịrị kwụọ bute ọgbaghara na ya bụ ụlọọrụ. Mgbe BBC gakwuru CMD ọhụrụ nke ụlọ ""Federal Neuropsychiatric Enugwu"" Dr Iteke Obiora gwara anyị na ọ ka bụ ọnwa abụọ ka ya rụrụ ọrụ dịka onyeisi. Iteke kwuru na-ekpokobaala otu ga-etinye ya bụ ihe ọnụ. Ndị ọrụ na ya bụ ụlọọgwu ji maka ọnwụ onyeisi ndị Nurse bụ Maria Amadi guzobe ekpere n'ọdọ ụgbọala ya bụ ebe. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49355357,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49355357,Ibrahim Zakzaky: 'Mba India nyere m awa abụọ ịpụ ala ha',Ibrahim El-Zakzaky kwuru na gọọmentị Naijirịa gwara mba India na ha amaghị ihe na-eme ya mana nke a bụ asị.,"O kwuru na ọ bụ ọgwụgwọ ka ọ biara ịnata n'India, n'ihi na e mechaala ya nnyocha na Naịjirịa. El-Zakzaky zaghachịrị akwụkwọ gọọmentị Naịjirịa depụtara site n'ihe onyonyo o wepụtara n'India, ebe ya bụ Zakzaky kwuru na gọomentị India nyere ya naanị awa abụọ ịpụ ala ha ma ọ bụrụ na o kwenyeghị n'ihe gọomentị Naịjirịa kwuru. O kwuru na ọ bụghi ya họpụtara ụlọọgwu ọ nọ n'India ""n'agbanyeghị na ụlọikpe Naịjirịa ekwetela n'ụlọọgwụ ndị dọkịnta ya họpụtara ka ọ gaa n'India"" End of Twitter post, 1 N'aka nke ọzọ, gọọmentị etiti nke Naịjirịa na-ekwu na ha anabataghị akwa onyeisi ndị ""Islamic Movement of Nigeria"" bụ El-Zakzaky na-ebe na-ekwu na ọnọdụ ya n'ụlọogwu ọ nọ n'India ka njọ karịa nke dị na Naijirịa. Akwụkwọ Grace Gekpe onye bụ odeakwụkwọ Ministrị na-ahụ maka Mgbasaozi na Ọdinala nke Naịjirịa depụtara, kwuru na El-Zakzaky bidoro kpawa agwa na-ezighị ezi mgbe ha rutere Dubai ebe ha si gawa India. Akwụkwọ a kwuru sị na ọ bụ El-Zakzaky ji aka ya họpụta ụlọọgwụ ọ chọrọ n'India, ma ndị ndu ga-echekwa ya, ma tinyekwa ndị dọkịnta so ya gaa. Gekpe sị na "" O kwuru ka e nye ya akwụkwọ-ikike-ngafe ya, mana ndị gọọmentị ha na ya so ekweghị, agwa ya bịara kawa njọ mgbe o ruru India mgbe ọ na-ekweghị ka e mee ya nnyocha ahụ"" Akwụkwọ a kwuru na "" Ọ chọro ka e nye ya ohere ịgagharị etu ọ siri chọọ, kwuokwa ka etinye ya n'ụlọobibi na ọṅụṅụ nke dị okeọnụ ma chọọkwa ka o jiri aka ya họpụta ndị dokinta ga-elete ya anya n'ụlọọgwụ Medenta, India, mana nke a megidere ụkpụrụ ndị ọgwụgwọ"". Ihe ndị a El-Zakzaky na-achọ mere ka ndị ụlọọgwụ India wee iwe ma kwuo na ha dị njikere ịkpọlata ya Naịjirịa. Ụlọikpe kacha elu nke Kaduna nyere onyeisi ndị IMN ikike ịga India maka ahụike. Gekpe kwuru sị na ndị mba India si na ọ (El-Zakzaky) gaghị atụrụ ha ihe ha ga-eme, ma kwuokwa na ha agaghị enye ya ohere ime ihe ọbụla gbasara otu ya n'India. Gọọmentị Naijirịa arịọla gọomentị India mgbaghara maka agwa ọjọọ ha sị na El-Zakzaky kpasoro ha. Gekpe kwuru na gọọmentị dị njikere ikpe El-Zakzaky ikpe otu o ziri ezi ma ọ lọghachị Naijiria. O kwukwara na akwa El-Zakzaky na-ebe na ọnọdụ ya n'India ka ọnọdụ ya na Naịjirịa njọ, bụ mmiri awụrụ n'okwute. Akụkọ ka na-abịa. Lee akụkọ ga-amasị gị Lee ihe nkiriga-amasị gị 'Ihe na-agbata m n'uche bú maóbú etu ka m ga-esi laa' - Onye ndị ntọrị nwụchịrị" afirika-44920966,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44920966,Ndị bu egbe agbagbuola ọkwọụgbọala 11 na South Africa,Ndị uweojii mba Saụt Afrịka kwuru na ndị omekome wakporo ma gbuo ndị na-anya tagzi 11.,"Mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ezigbo ahụ ka mgbọ egbe tụrụ ha oge ndị omekome wakporo ụgbọala ha ji si akwamozu onye otu ha. Ụmụnwoke ahụ si mpaghara Gauteng aga Johannesburg oge ihe a mere. Ndị uweojii sị na ha amaghị ihe butere mwakpo a, mana ihe a ma bụ na ndọrọndọrọ dị n'etiti ndị na-anya tagzi ebutela ọgụ n'oge ndị gara aga. Jay Naicker bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na awakporo ụgbọala ahụ n'etiti obodo Colenso na Weenen. Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị ""A wakporo ụgbọala ahụ. Mmadụ 11 nwụrụ ebe anọ merụrụ ezigbo ahụ ma nọrọ n'ụlọọgwụ. E nweela ọtụtụ ọgụ n'etiti ndị na-anya tagzi na mpaghara ahụ, mana anyị ka na-eme nyocha ịma ndị kpara mkpamkpa a."" Tagzi so n'ime ụgbọala ndị mmadụ kacha aba na mba Saụt Afrịka bụ mba nde mmadụ 55 mejupụtara. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-49705857,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49705857,Chimamanda Adichie's Americanah: Gịnị ka Naịjirịa na Kenya na-azọ?,"Naịjirịa na Kenya bụkwa otu nna akpọrọ 'Afrịka' mụrụ ha mana ọdịka akwụkwọ ""Americanah"" nwa ada Igbo bụ Chimamanda Adiche akpariela ndọrọndọrọ n'etiti ha.","Ha abụọ nọ na soshal midịa na-ekwusi ike maka etu Lupita Nyongo bụ onye Kenya sị chọọ ịkpa agwa ka onye Igbo n'ihe nkiri a ga-eji akwụkwọ ahụ wee mepụta. Chimamanda akọwapụtala onye ""feministị"" bụ Chimamanda Adiche dere Amerịcanah n'afọ 2013. Lupita gotere ohere ijiri akwụkwọ mee ihe nkiri n'afọ 2018. Mgbe ahụ, Chimamanda kwuru na aka ya agaghị adị n'atụmatụ etu ihe nkiri esi akwụkwọ mepụta. Mana, ọ sịkwa na ya ga-agba mbọ hụ na enwetere asụsụ Igbo ọfụma na ya bụ ihe nkiri. Nke pụtara na o nwereike nye aka hụ na Lupita mere nke ọma na ya bụ ihe nkiri. Kemgbe WarnerMedia's kwuputechara ya, ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na-ekwesịghị ị nye Nyongo ohere ịkpa agwa ka onye Naịjirịa n'ihe nkiri Americanah makana o nweghị ire ndị mba ahụ. @Duke Edoho dere na twitter na ọ bụrụ na Nyongo kpa agwa dịka onye Igbo n'ihe nkiri a, ọgaghị atọcha ụtọ. Onye ọzọ kwukwara, ""anyị nwere ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri ọfụma na Naịjirịa ga-akpali agwa ahụ nkeọma"". Mana ndị Kenya nọ na twitter kwuchitere nwanne ha ọnụ na-ekwu na onweghị onye Nyongo nọchịrị ụzọ makana ọ bụ ọkaibe n'ihe nkiri. Ụfọdụ chetara ụmụ Naịjirịa na ọ bụ ndagwụrụgwu ọwụwa anyanwu Afrịka kpalitere mmuọ Beyonce ma kwalite ihe nkiri ya akpọrọ 'Lion King'. Akụkọ ndị ga-amasị gị" afirika-48656451,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48656451,Zamfara Killings: Mmadụ 34 ọzọ anwụọla ebe ahụ,Ndị uweojii kwuru na ihe ruru mmadụ iri atọ nwụrụ mgbe ndị ohi wakporo obodo Tungur Kahau n'ụbọchị Fraide.,"Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Shehu Mohammed gwara BBC na ha ezigala ụfọdụ uweojii ebe ahụ iji kwalite ọrụ ịchọpụta ndị kpara mkpa mkpa a. Atiku azọọla isi onwe ya End of Twitter post, 1 Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru otu PD agọrọla aka ya na ụkwụ ya n'ozi na-efegharị na ọ ga-eduba ụmụ Naịjirịa na ngagharị iwe maọbụrụ na ụlọikpe enyeghi ya ihe ọ chọrọ. O kpọrọ akụkọ ahụ ọrụ aka ndị aghụghọ. Na mba ofesi Dịka ọ dị ugbua ebe niile na mba Argentina na Uruguay nọ n'ọchịchịrị ugbua dịka ha enweghi ọkụ latrịk. Otu ụlọọrụ ọkụ latrịk gwara BBC na amabeghi ihe kpatara ya bụ ihe mana ọ malitere ebe elekere 11 nke ụtụtụ N'egwuregwu, Aka na-achịkọta otu bụ Mauricio Sarri Chelsea ahapụla otu ahụ gaa na otu Juventus ebe ọ ga-anọ ihe ruru afọ atọ dịka onye nkuzi otu ahụ. Ọ ga-anọchị anya Miaximillano Allegri pụrụ na ngwụcha afọ a." afirika-52980481,https://www.bbc.com/igbo/afirika-52980481,Christopher Columbus: Ihe i kwesịrị ịma maka nwoke a ndị na-eme ngagharịiwe kụturu na mba Amerịka,"Ndị na-eme ngagharịiwe maka ịkpa oke agbụrụ bụ nke ọnwụ George Floyd kpalitere ya ọzọ, akwatuola akpụrakpụ Christopher Columbus.","Ndị na-eme ngagharịiwe kwaturu akpụrakpụ Christopher Columbus dị na St Paul, dị na Minnesota na mba Amerịka Floyd bụ onye isi ojii dị afọ 46, nwụrụ n'obodo Minneapolis n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, dịka onye uweojii ji ikpere pido ya n'olu ihe karịrị nkeji asatọ ka ọ na-anwụchi ya. Ihe mberede a kpalitere nnukwu ngagharịiwe na mpaghara mbaụwa dị iche iche, ma bute nkụtu na mwepụ akpụrakpụ ndị mere nkwekọrịta nzuzo (confederate) dị na mba Amerịka, nakwa nke ndị zụrụ ma were ndị mmadụ mere ohu mgbe gboo, na mba ndị ọzọ. Na steeti Virginia dị na mba Amerịka, ndị na-eme ngagharịiwe kwaturu akpụrakpụ Christopher Columbus, mụnye ya ọkụ ma kwaba ya n'ime ọdọmmiri. Ndị na-eme ngagharịiwe gbasara BLM - nke pụtara ""Black Lives Matter"" gbakasịrị ụrọ n'akpụrakpụ Columbus dị na Miami Onye bụ Christopher Columbus? Christopher Columbus n'eserese Sebastiano del Piombo sere Gịnị mere ndị na-eme ngagharịiwe ji ewesara Christopher Columbus iwe? O teela Christopher Columbus ji bụrụ onye a na-enyo omume ya enyo n'akụkọ mgbe gboo, n'ihi etu o si kpaso ndị obodo ndị o zutere na njem ya agwa, nakwa ọrụ ọ rụrụ n'iji ike weghara ọchịchị n'aka ha. Ndị nwe obodo Amerịka na-azọchitere ndị mmadụ ikike ruru ha akwadoghi ugwu a na-akwanyere Columbus, ha kwuru na njem ọ gara n'Amerịkas butere mweghara ọchịchị n'ike nakwa ogbugbu ndị nna nna ha. Ụgbọmmiri yiri nke Santa Maria bụ nke Columbus ji eme njem ya Na nso nso a, ọtụtụ obodo na steeti dị iche iche kwụsịrị ịkpọ ụbọchị a kpọrọ ""Columbus Day"" ma kpọwazie ya ""Indigenous Peoples Day"", iji cheta ụfụ na ihe ọjọo niile ndị mmadụ gabigara n'aka Columbus na ndị ọcha ndị ọzọ na-eme ụdịrị njem ahụ. Ụfọdụ ndị na-eme ngagharịiwe kwuru sị na ha na kwaturu ma mebie akpụrakpụ Columbus ndị ahụ iji gosi na ha kwadoro ndị nwe obodo. Ihe nkiri a gbasara nwaafọ Naịjirịa ndị uweojii mba Amerịka gburu, ga-amasị gị: 'Chinedu Okobi nwanne m na-agara onwe ya ndi uweojii Amerika gbuo ya'" afirika-46498306,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46498306,Fake News: Onweghi mgbe m sịrị na Buhari agaghị asụlị Fulani - Lai Mohammed,Akụkọ dị mkpa,"Lai Mohammed agọrọla aka ya Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed agọọla na onweghi ebe ọbụla na mgbe ọbụla o kwuru na onyeisiala Buhari agaghị asụli asụsụ obodo ya bụ Fulani. Nke a bụ na nzaghachị akụkọ n'efegharị na o sịrị na Buhari agaghị asụlị asụsụ ha n'ihi nsogbu o nwere oge awarachara ụbụrụisi na mba ofesi. Mohammed gwara BBC Pidgin na ọ nọghị na Naịjirịa kamgbe, na kezie oge ọ nọ kwuo ya bụ okwu. Ọ kpọọrọ nke a akụkọ ụgha ma kwuo na ọ bụ ndị iro APC na-atụ asị a. Okorocha adọọla Ohanaeze Ndigbo aka na ntị Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Gọvanọ Okorocha nke Imo steet adọọla Ohanaeze Ndigbo aka na ntị ka ha ghara ịdọnyere onye ọbụla ukwu na ntuliaka afọ 2019 kama ka ha mee ka Ndigbo niile dị n'otu. Ozi a si n'aka onye odeakwụkwọ ya bụ Sam Onwuemeodo mgbe ndị na-ahazi emume ncheta ụbọchị Ndigbo kpọtụrụa n'Owere. Boko Haram egbuola ndịagha Naịjirịa ọzọ Ndịagha Naịjirịa nọ ọrụ nchekwa na-ibuso ndị Boko Haram agha na ọwụwa anyanwu nke ugwu Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa abụọ ọzọ anwụọla dịka ngalaba Boko Haram nke Abubakar Shekau bụ onyeisi ha wakporo ogige ndịagha dị na Gulumba nke Bama, Borno Steeti. Otu onye agha gwara ndị ntaakụkọ na ndị a ji ogbunigwe na gbagbu onwe nakwa ngwa agha ndịọzọ wakpoo ha n'oge abalị ụbọchị Satọde. Na mba ọzọ Gọvanọ nke Al-Qadarif Steeti dị na mba Sudan bụ Mirghani Saleh na mmadụ anọ ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu Helikọpta. A chọpụtabeghi ihe butere mkpọkasị ụgbọelu a mere na mpaghara ọwụwanyanwụ nke Sudan. N'egwuregwu Onye na-agbara Manchester City bọọlụ bụ Raheem Sterling ekwuola na ndị na-ede akwụkwọ ntaakụkọ na-enye aka n'ịkwado ịkpa oke agbụrụ site n'ụzọ ha ji egosi ndị isi ojii na-agba bọọlụ. A kpasoro Sterling oke agbụrụ a n'asọmpi Manchester City na Chelsea gbara. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma Ụgwọ ndị mmanụ ụgbọala Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-akwụ ndị ahịa mmanụ ụgbọala na nke agbịdị, ijeri naịra narị abụọ na iri atọ na isii n'izu a, nke bụ oke n'ime ijeri naịra narị atọ na iri anọ na asatọ e ji ha maka ụgwọ enyemaka. Henry Ikem-Obih bụ onyeisi nlekọta ọrụ na NNPC Downstream, kwuputere nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Satọde, Disemba 8, 2018. O kwukwara na n'agbaneyghi na ndị ahịa mmanụ ji gọọmentị ụfọdụ ụgwọ, na agaghị amịpụ ya n'ụgwọ mbụ a gọọmentị ga-akwụ ha. Ikem-Obih kwukwara na gọọmentị ga-akwụ oke ọzọ n'ime ụgwọ a n'afọ 2019, ma kwụchazie ya n'afọ 2020. Cheta na ndị na-ere mmanụ kwuru na Gọọmentị ejigbuola ha n'ụgwọ nso nso a. A kpọchiri ọbaego Peter Obi? Ọnụ na-ekwuchitere Peter Obi bụ Val Obienyem, gwara BBC Igbo na ha amaghị ihe mere e ji kpachie ọbaego onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala PDP, ma kwuo na ha na-eche ịnụ ihe onyeisiala nwere ikwu gbasara ya tupu ha amara ihe ha ga-eme. Mana otu na-ahụ maka nyocha mpụ na nrụrụaka bụ EFCC, agọrọla ụkwụ ha na aka ha, na ha amaghị maka ya. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A kpọchiri ọbaego Peter Obi n'ezie - Val Obienyem Na mba ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na John Kelly bụ onyeisi ndị ọrụ gọọmentị ya, ga-awụsa ọwa na ngwụcha afọ a. Ọpụpụ Kelly ga-eme ya mmadụ iri abụọ na asatọ so Trump bido ọrụ na-apụ n'ọrụ n'ime afọ abụọ ọ bụrụla onyeisiala. N'egwuregwu, Mmeri Tottenham meriri otu Leicester City emeela ka ha nọrọ n'ọkwa nke atọ na tebulu Premier League. Ebe Chelsea meriri Manchester City si n'ọkwa mbụ gbadata n'ọkwa abụọ, nọ n'ọkwa nke anọ na ya bụ tebulu. Akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ndị na-eji igwe akpụ ụzụ gwara BBC na ha anaghị eji akpụobi ha achọ okwu, na ha na-eme ya ka ha nwee ike ""tọọ ụtọ"" n'anya. Body Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada" afirika-48447722,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48447722,Ned Nwoko: Ụlọikpe mkpegharị awụọla Nwoko ụkwụ n'ala,Akụkọ dị mkpa taa,"Ụlọikpe anarala Ned Nwoko ụra rahụ Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja akagbuola mmeri Ned Nwoko dịka Senetọ na-anọchịte anya Delta-North n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọikpe nọrọ n'ụbọchị Tọzde kwụọ na mkpebi ụlọikpe ukwu nke chụdarar Peter Nwaobosi ma nyere Nwoko mmeri adabaghị. Ụlọikpe mkpeharị nke ọkaikpe atọ nọ n'isi ya kwuru na ụlọikpe ahụ kpere ike enweghị ikike ịnụ akwụkwọ ahụ nke Nwoko gbara. Ha kwukwara na Nwoko onye gbara akwụkwọ ahụ kwesịrị ịgba ya abalị iri na anọ ihe o jiri maka ya gbaaa akwụkwọ mechara. Cheta na Inec napụrụ Peter Nwaoboshị asambodo mmeri ha nyeburu ya dịka ụlọikpekswwu ebe Nwoko gbara akwụkwọ nyere mkpebi na ọ bụ Nwoko meriri. Ncheta Biafra di ire n'Anambara mana ọdịchaghị ire n'alaigbo ndị ọzọ Oku nọrọ n'ụlọ nke otu na-agba mbo maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob kpọrọ taa bụ abali iri atọ nke ọnwa Mee mabụrụkwa Ụbọchi Ncheta Agha Biafra gara ka ụka akpara nke e ji isi ekwe n'ụfọdụ ebe ụfọdụ na Anambrara na Abia dịka Nnewi, Onitsha, Ogbunike, Aba na Afaukwu. Lee ndị mmadụ na ụgbọala n'Umudike Junction, Umuahia Ụlọikpe mkpegharị anarala Ned Nwoko ụra rahụ Mana ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'Enugwu, Imo State, Ebonyi . Ihedioaha agọla na ọ́ka ya adịghị na nkutu Akachi Akpụrụakpụ Akachi ka ọ dị taa bụ Wenezde Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Emeka Ihedịọha nke Imo steeti bụ Steve Osuji ekwuola na gọọmenti steeti ahụ amaghị maka nkutu a gbalịrị ikutu akpụrụakpụ Akachi nke Rochas Okorocha kpụrụ ụbọchị Wenezde. Onyeisiụlọomeiwu Imo steeti ọhụrụ agbaala arụkwaghịm Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti ọhụrụ bụ Lawman Duruji etinyela akwụkwọ arụkwaghịm naanị abalị abụọ ọ nọọrọ n'oche. Duruji onye na-anọchite anya okpuru ọchịchị Ehime Mbanọ ekweghị hooha ihe mere o jiri tinye akwụkwọ arụkwaghịm. Ka ọ dị ugbua, Chinedu Offor werela oche dịka onyeisi ọhụrụ Ụlọomeiwu Imo steeti. Gee akụkọ ndị ebe n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Fake certificate: Adeleke emeriela n'ụlọikpe mkpegharị Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja akagbuola mkpebi ụlọikpe ukwu nke kwuburu na Ademola Adeleke etozughi izo ntuliaka gọvanọ Osun Steeti e mere n'afọ 2018. Jọstis Othman Musaon nke ụlọikpe ukwu kpebiburu na Adeleke etozughị n'ihi na asambodo sekondrị ya bụ nke adigboroja. Buhari ga-efepụ taa O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Naịjirịa ga efepụ ọzọ Ọ bu ụnyaahụ ka Muhammadu Buhari ṅụrụ iyi ọrụ oji banye n'isioche Naịjirịa ọzọ N'ụtụtụ a, ọ na-akwado ị ga mba Saụdị Arabịa. Buhari na-ga nzụkọ mba ndị so n'otu ụka alakụba bụ Ọrganisation of Islamic Countries. Lee etu o ịṅụ iyi siri gaa ụnyaahụ abe a: Nke a mere ya ugboro abụọ Chelsea na-amabute iko Europa League a Chelsea sụrụ Arsenal akwụ Ụnyaahụ Chelsea sụrụ Arsenal akwụ n'asọmpị ha ji mechie Iko Europa. Goolu Olivier Giroud , Pedro na abụọ Eden Hazard tiwara Arsenal obi, agbanyeghị na nwaafọ Naịjirịa Alex Iwobi dọkatara otu okpu. Gụọ akụkọ n'ụjụ ebe a: Etu ọ sọrọ ụwa ya mee, Arsenal gba aka iko n'afọ a N'Anambra, ndị uweojii ekwuola na ha etipiala otu aka ha dị n'izu ụmụaka. Haruna Mohammed kwuru na ha ji umụnwaanyị abụọ na-akpa ike a ma zọpụtakwa otu onye nọ ha n'aka. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha ji mmadụ iri isii na itoolu maka echiche na ha so n'otu nzuzo. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyi nke taa: Ihe ngwa egwu Igbo jiri masị anyị - Chikaima na Chinonoru Buhari ga-efepu taa" afirika-46671576,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46671576,Muhammadu Buhari gwara Aisha: Gosi m ihe akaebe,Akụkọ dị mkpa taa:,"Buhari asaala nwunye ya okwu gbasara 'cabal' Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala nwunye ya na ndị na-ekwu na e nwere ndị na-ekwu ihe na-eme n'ọchịchị ya ka ha wepụta ihe akaebe gosiri ya. O kwuru nke a oge ya na ụlọntaakụkọ 'Voice of America' ngalaba nke Awụsa, nwere mkparitaụka ebe ha jụrụ ya ọsịsa ya nye ebubo nwunye ya na o nwere mmadụ abụọ na-ekwu ihe na-eme n'ọchịchị ya. ""Nke ahụ gbasara ya. Ọ na-egosikwa na m bụ ezi onye kwenyere n'ọchịchị onyekwuoucheya site n'ịhapụ onye ọbụla ka ha na-ekwu obi ha. ""Ndị na-ekwu na o nwere ndị na-achị n'aha m weta ihe akaebe."" Cheta na abalị anọ nke ọnwa Disemba afọ 2018, nwunye Buhari nọ n'ọgbakọ ụmụnwaanyị e nwere n'Abụja kwuo ma ọ bụghị mmadụ abụọ, na ọchịchị Buhari kara imepụta ihe karịa ka o mere. ""Gọọmentị gbatara anyị ọsọ enyemaka"" Ụmụ Naịjiria gọọmentị na-akwụrụ ụgwọ akwụkwọ na mba Moroko ebekuola gọomentị ka a gbatara ha ọsọ enyemaka. Ha kwuru na agụrụ gburu agbọghọ na-achọzị igbu ha makana gọọmentị ji ha ụgwọ ego enyemaka kemgbe ọnwa iri na abụọ. N'ofesi, Nwaanyị mbụ ga-abụ gọvanọ n'obodo Pebla dị na Mexico anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu. Martha Erika Alonso, di ya, ndị ọkwọụgbọelu abụọ nakwa otu onye ọzọ so nwụọ n'ihe mberede a mere naanị ka ụbọchị iri e ji duo ya iyi ọrụ gafere. N'egwuregwu, Chelsea na Watford ga-ezute, Arsenal ga-ezute Brighton, Man Utd ga-ezute Huddersfield, Liverpool ga-ezute Newcastle, ebe Mancity ga-ama ma ha a ga-anata Leicester City isi ha, mgbe ha ga-ezute onwe ha n'ụbọchị Bekee kpọrọ ""Boxing Day"". Ọkụ agbagbuola nwatakịrị: Ezinaụlọ nwatakịrị a ma dịka Chikamso Nnamani, nọ n'iru uju ugbua maka ihe mberede dakwasịrị ha n'ụbọchị 23 nke ọnwa Disemba. Dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu si kwuo n'akwụkwọ ozi o kesara ọkụ ahụ malitere ịgba ka Chikamso dị afọ asatọ gara ịwụnye mmanụ ọkụ(kerosine) n'ime mpanaka ha. Ọkụ ahụ si na mpanaka gbaba n'ime ngwongwo ndị dị n'ime ụlọ, ma mụbanye, nke mechara gbaa Chikamso ọfụma. Ihe mberede a mere n'obodo Umundu dị n'ọchịchị ime obodo Udenu dị n'Enugwu steeti. Onyeisiala Muhammadu Buhari, osote ya bụ Yemi Osinbajo nakwa onyeisi otu APC na Naịjiria niile ejirila egwu kelee ụmụ Naịjrịa na-asị ha 'anyị na-asị unu ekeresimesi ọma' Ha mere nke a ụnyaahụ n'isi ụlọọrụ Naịjirịa dị n'Abuja. Ọzọ, Otu APC ekwuola na nwereike iji ike mee ịchụnta vootu ha n'ọgbọ egwuregwu Akpabio nke dị na Akwa Ibom Cheta na gọọmentị Akwa Ibom jụrụ mbụ ịnye otu APC ikike ịji ọgbọ egwuregwu ahụ mee ịchụnta vootu nke ọkwa onyeisiala n'abalị ole na ole gara aga. Mana ugbua, akụkọ pụtara na-ekwu na Gọvanọ Emmanuel Udom enyela ikike iji ya bụ ọgbọ mee achụmnta vootu ha. Na mba ofesi Popu Francis Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Francis agwaala mmadụ niile ha ṅomie obi ruru ala etu Kraist si nwe dịka amụrụ ya n'ụlọ anụmanụ N'ozi o nyere, ọ gwara ndị mmadụ ha cheta ọmụmụ kraist site n'ịnye nakwa ịkee ihe ha nwere n'oge a. Dịka ọ bụ oge ekeresimesi, gaa nụ na Facebook anyị bụ bbcnewsIgbo ka unu gwa anyị egwuregwu dị icheiche unu na ezinaụlọ unu na-egwu n'oge ezumike a. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45608288,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45608288,Akụkọ dị mkpa taa: Ipob na United Nation nwere nzukọ,Akụkọ dị mkpa taa,"Nzukọ Ipob na United Nation Ndị isi otu Ipob na otu United Nation nwere mkparịta ụka na Switzerland n'abalị iri na anọ nke ọnwa Seputemba maka ogbugbu ndị otu na Naịjirịa. Emma powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu a kwuru na ọ bụ osote onye ndụ ha bụ Uche Mefor du ndị ipob mee njem ahụ. Ntuliaka Osun steeti akụrụla ọnụ Ntuliaka na-aga n'ihu n'Osun state Dịka ọ dị ugbua ntuliaka ịhọpụta gọvanọ Osun Steeti akwakọrọla ọnụ na-enweghi ọgbaghara ọbụla. Ụlọọrụ INEC na-agụkọzi akwụkwọ mbinyeaka na Wọdụ na Wọdụ tupu akpọpụta aha onye meriri na ntuliaka. Akụkọ si mba ofesi Ndị oji egbe agbagbuola mmadụ ruru iri abụọ na ise na mmemme ngosi ndị agha Iran mere n'obodo Ahvaz nke mba ahụ. Ndị agha nnupuisi Ahvaz National Resistance nakwa Islamic State ekwuola na ọ bụ ha mere mwakpo a. N'egwuregwu Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka CAF amachiela onye ogbu bọọlụ mba Guinea bụ Baba Leno igbu bọọlụ n'afọ iri. Nke a bụ dịka nyocha onye ntaakụkọ Anas chọpụtara na Leno naara ego dị narị dọla ise bụ nke o kwetara na ọ bụ eziokwu. Nkeji Nke abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Mgba ndị obodo Igbuzo n'emume iri ji ọhụrụ ha. Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo Nwata makata mma... Anita Ukah nke si n'Imo steeti abụrụla agbọghọ makarịchara na Naịjirịa niile dịka emere nyocha n'abali Fraide ụbọchị 22 nke septemba. Anita meriri Miss Nigeria bụ onye Imo steeti Nwaada Ukah meriri ụmụagbọghọbịa ndị ọzọ ruru iri atọ n'isii ndị nọchiri anya steeti ndịọzọ na Naịjirịa nakwa isiobodo bụ Abuja. Ihe nke a pụtara bụ na ọ ga-anọchị anya Naịjirịa na nchọpụta a ga-eme na China n'ọnwa disemba ịji mata agbọghọ makarịrị na mba ụwa niile. Ọzọ, Anya mba Naịjirịa niile nọ n'Osun steeti ugbua dịka ha na-akwado ịme ntụliaka họpụta onye ga-achị steetị ha n'afọ anọ n'abịa. Dịka ndị mba ofesi bịara ịme nyocha na-ekwu na ha kachasị etinye anya n'ihe gbasara nrụrụaka vootu. Na Delta, Otu nwaanyị amụọla nwa n'ogige ndị gbara ọsọndụ site n'idemmiri nke dị n'Asaba na Delta steeti. Nwaanyị ahụ bụ Oriakụ Chidinma Ismaila kelere gọọmentị steetị ahụ maka enyemaka ha nyere ya ị mụpụta nwa ya. Na mba ofesi A mụrụ otiegwu a na Barbados Mba Barbados echiela onye otiegwu bụ Rihanna echichi dịka Onye nnọchị anya ha bụ ambassador na bekee Ọrụ ya ga-achịkọta ihe gbasara agụmakwụkwọ, ịtinye ego n'obodo nakwa ịnabata ndị ọbịa nke pụtara Tourism na bekee N'egwuregwu, Onye ọgba bọọlụ otu Arsenal Pierre Emmerick Aubameyang ekwuola na nna ya ekwuputabeghị na ọ ga-achịkọta otu egwuregwu mba Gabon. Iwe ya bụ na ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ kpọpụtara aha nna ya dịka onye nkuzị ọhụrụ ya na-anụbbeghị ma o kwetala ị nara ya bụ ọkwa. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo" afirika-46554518,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46554518,Vice Presidential Debate: Ihe mere Peter Obi ji ewu,Akụkọ dị mkpa:,"VP Debate: Ihe mere Peter Obi ji ewu Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'aha ndị PDP gosiri na ihe dị iche dị n'egbe na egbe na ndọrịtaụka mere n'etiti ndị ogbo ya sị na pati ise soro dọrịta ụka n'abalị Fraide. Nke a mere ka aha ya na-ada ka akị bekee na soshal midia dịka o ji okwu ihe mere, ọnụọgụgụ nakwa ụzọ mgbapụ were gbazie ụzọ Naijiria ga-esi gbalahụ ọtụtụ nsogbu na-anyịgbu ya. Iji ma atụ, Obi sị, 'N'afọ 2015, ego si n'aka ndi ojiegoachụego mba ọzọ bata Naijiria dị ijeri dọla 41($41bn) mana n'afọ gara aga, anyị nwetara naanị ijeri dọla 12($12bn)"" End of Twitter post, 1 Aminu Tambuwal kwuru na etu Peter Obi ji ihe ndị merela, ọnụọgụgụ na -akọwa okwu ya gositrri naotozuru ịrụ ọrụ dịka osote onyeisiala. @Jennysville kwuru na ihe gbasara mwulite akụnaụba doro Peter Obi anya. @bolanle_cole kwuru na Obi ji ihe mere nakwa ọnụọgụgụ zaa ajụjụ n'ụzọ gosiri na ọ ma ihe ọ na-ekwu. Ọ bụghịzị Donald Duke ga-efe ọkọrọtọ SDP Otu ụlọikpe dị n'Abuja ekpebiela na ọ bụ Jerry Gana, onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, meriri ntuliaka imeụlọ ndị Social Democratic Party (SDP). Nke a pụtara na ọ bụghịzị Donald Duke ndị SDP kpọpụtara aha ya dịka onye meriri, ga-anọchite anya pati a na ntuliaka 2019. Na ntuliaka imeụlọ ha mere, e kwuru na Duke nwetara vootu 812 ebe Gana nwetara 611. Mana Gana gbara akwụkwọ n'ụlọikpe kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ife ọkọrọtọ pati ha maka ihe iwu pati ha kwuru maka ime ihe Bekee kpọrọ ""zoning"". Mkpebi ọkaikpe Hussein Baba-Yusuf, kwuru na onye ọbụla nọ na pati kwesịrị iso usoro iwu pati ma rubere ya isi. Nzukọ Buhari na ndị gọvanọ Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị gọvanọ ka ha gbaa mbọ hụ na ha lebanyere anya n' ihe owuwu ndị na-adakpọ adakpọ iji kwalite akụnaụba steeti ha. Abdulaziz Yari bụ onyeisi ndị ọgbakọ ndị gọvanọ gbaara ndị ntaakụkọ ama a ka ha na Buhari nwechara nzukọ. Yari ekweghi asa ajụjụ banyere ihe ha kpebiri n'okwu ụgwọ opekatampe. Chary Boy na nwunye ya agbasaala? Charly Boy bụ otiegwu ama ama agwala BBC na ọ bụghị alụkwaghịm ka ọ na-agba nwunye ya bụ Diane dịka o si dee na soshal midia. O kwuru na ha na-alaghachị n'ụlọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya ha abụọ kpebiri afọ iri anọ gara aga. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: M na nwunye m sị ka anyị 'chenjikwaanụ gear' - Charly Boy Gịnị ka mpụrụobi na-eme n'ikuku? Otu ụgbọelu Southwest Airlines bu ndị mmadụ si obodo Seattle na-aga Dallas dị na mba Amerịka, laghachiri azụ ka o bidochara njem ka a hụrụ mkpụrụobi mmadụ e kwesịrị ibuga ụlọọgwụ n'ime ya. E mechara buga ya ụlọọgwụ ebe a na-edowe ihe si n'ime ahụ mmadụ. N'egwuregwu, Rafael Benitez enwetala ihe nrite dịka ""onye nchịkọta kachasị mee ọfụma na Premier League"" nke ọnwa Nọvemba. Nke a bụ ugboro ise Benitez na-achịkọta otu Newcastle United na-enweta ihe nrite a. Gee Nkeji BBC Igbo ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Kedụ usoro ọchịchị ga-amasị Naịjirịa? Ihe ruru ndị omeiwu iri abụọ na abuọ akpọọla oku ga-agbanwe usoro ọchịchị ala Naịjirịa. Iwe ha bụ na ụsoro ịnwe onyeisiala na-erị oke ego nakwa anaghị enye ụmụ Naịjirịa ụdịrị ọchịchị ziri ezi. N'okwu ụgwọ opekatampe Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ Ọgbakọ ndị gọvanọ ala Naịjirịa ekwuola na ha ga-ezute onyeisiala Muhammadu Buhari taa iji kpebie ego ole a ga na-akwụ dịka ụgwọ opekatampe na Naịjirịa Ha kwuru nke a ụnyaahụ na-ekwukwa na ha nwere olileanya na okwu a ga-ebi tupu ngwucha afọ a Gụọ ya n'uju ebe a: Okwu 'Minimum wage' a ga-ebi taa? Na mba ofesi, Ndị uweojii na Fransị agbagbuola otu nwoke echere na ọbụ ya wakporo ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg. Cherif Chekatt bụ ụzọ gbaa ndị uweojii egbe mgbe ha chọtara ya tupu ha gbagbuo ya. N'Egwuregwu, Onyeisi ngalaba na-ahụ maka eguwregwu bọọlụ n'ụwa niile akpọrọ FIFA bụ Ginanni Infantino ekwuola na mba ndị chọrọ ka ewelie ndị ga na-agba asọmpị FIFA site na iri atọ na abụọ ruo iri anọ n'asatọ O kwukwara na ọ bụ n'ọnwa maachị nke afọ n'abịa ka FIFA ga-enwe mkpebi gbasara ya." afirika-46629928,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46629928,Tiwa Savage na Yemi Alade a na-akọ ọnụ otele?,Akụkọ dị mkpa,"Akụkọ na-efegharị na soshal midia bụ na Tiwa Savage na Yemi Alade na-ekpere onwe ha ikpe banyere onye otele ya ka ibu. Yemi Alade bulitere okwu oge o dere na Twitter ya na ""Ọ bụghị ime ka otele gị dịka ka oburu na foto, Ị ma na ị dịka akara edemede 'I'. Kwụsị ịghọgbu ndị ihe gị na-amasị. Were onwe gị ka chi gị ssi kee gị."" End of Twitter post, 1 N'otu aka ahụ, Tiwa jikwara ikpe saa ya. Tiwa gara n'ihu gwa ya ka ọ ghara ibido ọgụ ọ gaghị alụchali. 'Ọgụ' ahụ butere ndọrịtaụka n'etiti ndị ihe ndị otiegwu abụọ ahụ na-amasị. Ebe ụfọdụ kwunyere Tiwa, ndị ọzọ kwụnyere Yemi. @Terrybrainz kwuru na Yemi na-eghu Tiwa anyaọkụ kemgbe. @Bigstan82745069 kwuru na Yemi Alade ka Tiwa Savage eewu na mba ofesi ọkachasị n'Afrịka, na otele ya kakwa nke Tiwa Yemi Alade mechara rịọ mgbaghara maka ihe a odere, ma si na ọ bu ndụmọdu ka ya na-enye ndị mmadụ. Ọkụ gbara ụgbọala mmanụ na Legos Ọkụ agbala mmanụ na-ebu mmanụ na nso Maryland Bridge dị na Legos. O nweghị onye ma ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ mana o mere ka ahịrị ụgbọala karia n'okporoụzọ gawara Ọjọta na Ketu dị na Legọs. A kpọchiri ebe e hiwere mmalite ọsọ achụmnta vootu Hope Uzodinma n'Owere Ndị a na-eche na ha na-arụrụ gọọmenti Imo steeti ọrụ kpọchiri ama egwuregwu Dan Anyiam dị n'Owere ebe e hiwere mmalite ọsọ achụmnta vootu Hope Uzodinma. Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo n'ekwentị, o kwuru na Uzodinma etinyeghị akwụkwọ iji nata ikike iji ama egwuregwu ahụ mee ihe n'aka Kọmịshọna ọ dị n'aka. EFCC nwuchiri mmadụ abụọ n'Enugwu EFCC na-alụ ọgụ megide mmerụaka na ala Naijiria Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC mpaghara Enugwu anwụchiela mmadụ abụọ bu nde dọla abụọ n'ụma ụbọchị Tọsde na ọdọgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Ndị uweojji Spen na ndị Katalonia kwatara Ndị uweojii mba Spain na ndị obodo Catalonia ndị na-achọ nnwereonwe site na spain kwatara na Barcelona. Ndị Catalonia ndị na-emem ngagharịiwe tụrụ ndị uweojji okwute,ebe ndị uweojii siri okporo saa ha. Roy Keane katọrọ ManU maka Mourinho N'egwuregwu, Onye bụbụ onye ndụ otu bọọlụ Manchester United bụ Roy Keane akatọla agwa ndị egwuregwu otu ahu kpasara Jose Mourinho. Keane sị na agwa ha kpara tupu a chụọ Mourniho bu ihe mechụ ihu. Ọ sị na nke a gosiri na ha abụghi ndị zuru ka eme. Ndi omekome awakpola ime obodo na Zamfara Ndi mere ihe ahụ gbagburu ụmụaka na ndị okorobia na-agbalị iche obodo ahụ nche Akụkọ sị Zamfara na-akọwa na ọtụtụ mmadụ nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo ime obodo atọ na steetị ahụ. Mwakpo a mere na n'okpuru ọchịchị ime obodo Birnin Magaji. Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ n'ugbo ha mgbe ajọọ ihe a bịakwutere ha. N'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, Onyeisi ndị Omeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki akatọla bọọjetị Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ya na ndị otu ya ụbọchị Wenesde. Saraki sị na ya bụ ihe Bekee kpóró Budget 2019 agaghị enyere Naịjirịa aka. Ka nke a na-eme, onye bụbụ osote gọvanọ na Kano edurula ụfọdụ ndi na-akwado aka chịbụrụ Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso laghachi APC. Hafizu Abubakar na ndị otu ya so kwankwaso gbaga PDP n'afọ a, mana ha ekwughi ma ọ ga-eso ha n'azụ na nlaghachi a. N'ofesi, James Mattis na Donlad Trump Onye odeakwụkwọ Amerịka n'ihe banyere nchekwa bụ Jim Mattis etinyela akwụkwọ arụkwaghịm Mattis sị na ya mere nke a makana echiche ya gbasara etu Amerịka na mba ofesi ga-emekọta adabaghị. Ihe na-eme ka Trump si ndị agha Amerịka nọ agha na mba Sirịa lọta. N'egwuregwu, Naịjirịa na mba Congo, England na Czech ga-asọ mpi enyi na enyi tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie Super Eagles nke NaỊjirịa ka bụkwa ndị nke iri anọ na anọ n'ụwa. Nke gosiri na ha apụghi n'ọkwa ha no n'ọnwa Ọktoba. Eagles bụ ndị nke anọ n'Afịrịka ka Senegal ka tụrụ ugo dịka ndi nke mbu n'Afịrịka. Gee akuko a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Ọ ga-ekwe gị mee, kwuo ihe bụ 'Flag' n'Igbo" 44499680,https://www.bbc.com/igbo/44499680,Akụkọ kachasị n'abali a: Trump na China na-ama aka n'ihe gbasara azụmahịa,Akụkọ kachasị mere taa;,"E mewaala ndị Ijipt obi Mohamed Salah gbajiri aka ka otu egwuregwu Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ngwụcha Champions League tupu Iko Mbaụwa ebido Ndị Ijipti ebeela akwa arịrị ka ndị mba Yuregụaị meriri ha n'asọmpi abụọ nke Iko Mbaụwa a gbara taa. Onye egwu bụ Jose Gimenez nyere goolu na nkeji iri itoolu, mewara ndị Ijpti obi ma mee ka ọtụtụ buru aka n'isi. Ọkaiwu Evans eserela aka Chukwudumeme Onwuamadike ama dịka Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwú Chukwudumeme Onwuamadike nke a ama dịka 'Evans' bụ onye a na-enyocha maka ịtọ mmadụ, esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka. N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a. Trump na China a na-ese okwu? Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-atụkwasị ego ụtụ ruru pasentị iri abụọ na ise n'elu ngwaahịa ndị si China. O kwuru nke a ka ọ na-ebo ndị Beijing ebubo maka izu ihe mmepụta ọnatarachi nke bekee 'intellectual copyright theft'. Ndị Naịjịrịa chọrọ ịnwụ ọkụkọ gaa Rọshịa Mba Rọshịa machiri ndị nkwado otu Super Eagles chọrọ iji ọkụkọ gaa n'ama egwuregwu maka asọmpi Naijiria nwere na ngwụcha izu a. Cheta n'asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2010 nke mere na Saụt Afrika, a machiri ndị nkwado Super Eagles iji ọkụkọ e tere uhie njirimara Naijiria n'ahụ banye amaegwuregwu Ellis Park dị na Johanesbọg maka asọmpi ha na Agentina. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Ndi Igbo zara azịza maka ntuliaka 2019" afirika-46498311,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46498311,Uweojii na-enyocha mwakpo Fada Mbaka - Amaraizu,Akụkọ dị mkpa:,"Mwakpo Fada Mbaka Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu ekwuola na ndị uweojii amalitela nyocha banyere mwakpo a sị na e mere Fada Mbaka. Amaraizu gwara BBC Igbo na ha natara mkpesa si n'aka onye ụkọchukwu a nke mere ya na kọmishịọna ndị uweojii nke Enugwu Steeti bụ Malam Muhammed gara kpọtụrụ Fada Mbaka n'ụlọ ya taa. Amaraizu sị na Mbaka kwuru na mwakpo a mere na ""Naira Triangle"" dị nso na Mega nke Enugwu Steeti. Amnesty International Ndị awakporo be ha na Borno n'afọ 2015 Otu Amnesty international enyeela Ulọikpe Mbaụwa bụ ICC iwu ka nyochaa n'ozuzu mpụ na arụ niile e merela n'ibu agha megide Boko Haram. Otu a bokwara Naịjirịa ebubo na ha maara afọ n'ala n'ikpe ndị aka ha dị n'aya ikpe ziri ezi. N'ofesi Praịm minista mba Briten bụ Theresa May akagbuola ntuliaka ekwesiri ime iche maka nkwekọrịta 'Brexit' n'ihi na ọtụtụ ndị ga-ajụ ya. May kwuru na o kwesiri ike na ọ ga-enwete nkwerịkọta ahụ ma o leba anya na ihe bụ nsogbu ndị a.] N'egwuregwu Cristiano Ronaldo na-agbara Juventus bọọlụ agwala ogbo ya bụ Lionel Messi ka ọ hapụ mba ịgba bọọlụ na Spen bịa n'Itali ka anyị chịpụ ya. Ronaldo hapụrụ otu egwu Real Madrid nke mba Spen ma gawa Juventus n'afọ a. Ma cheta na mmadụ abụọ ndị a bụ ndị a na-eche na ha kachasị agba bọọlụ na Mbaụwa niile. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Nnewi: Omenaala Umudim bukọtara obodo 14 dị n'ime ya Obasanjo Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo, akatọọla etu ụfọdụ ndị ntaakụkọ si kwugharịa ihe o kwuru ụbọchị ole gara aga. Iji tuzie aka, ọ kọwara na ihe o kwuru bụ na ọ gaghị amanye ndị Naịjirịa onye ha ga-atụnyere na ntuliaka, kama na ndị Naịjirịa kwesịrị ịtụnyere ndị ga-arụ ọrụ hụ na ndụ ha dị mma karịa etu ọ dị ugbua. Nhazi akwụkwọ iwu ntuliaka Na nzukọ ""Executive Session"" a ga-enwe taa, a ga-ekpebi ihe a ga-eme maka ọjụjụ onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ibinye aka n'ihazigharị akwụkwọ iwu ntuliaka. Mara na ndị mmadụ gụnyere Mike Ozhekome, Atiku Abubakar na ndị isi a hụrụ kwaba okpu ndị ọzọ, katọrọ omume Buhari gbasara ya, na-ekwu na ọ dị ka ọ na-atụ ụjọ na ọ gaghị emeri na ntuliaka 2019. Mmanụ ụgbọala ọ ga-akọ? Ọ bụrụ na ị chị obi n'aka maka etu ị ga-esi eme mmanụ ụgbọala dịka a na-atụ ụjọ ma ndị na-ere ya a ga-agba abụbụọrụ, wetuo obi gị. Igwe e ji ere mmanụ Nke a bụ makana Ndu Ughammadu bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ụlọọrụ NNPC, kwuru na ha nwere ebe mmanụ dọ, nke ga-ezu ndị mmadụ ihe ruru ụbọchị iri ise na abụọ. Gụọ maka ya n'uju ebe a: 'Anyị nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru unu ' - NNPC Na mba ofesi, Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron, na ndị isi otu chịkọtara ndị azụmahịa na ndị otu ndị ọrụ, ga-enwe nzukọ ebe ha ga-achọ inweta mkpebi maka ngagharịiwe a na-enwe na mba ya n'ime izu anọ. Gere akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-46535903,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46535903,"ASUP strike: ""Gọọmentị emezubeghị nkwa ha kwere anyị""",Akụkọ dị mkpa,"Otu jikọrọ ndị nkuzi na-arụ n'ụlọ akwụkwọ dị elu nke Politeknik bụ ASUP n'aha ịchafụ amalitela abụbụọrụ. Onyeisi ha bụ Usman Dutse, gwara BBC na ọ bụ makana gọọmentị etiti emezubeghị nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 nakwa 2017. Minista agbaala arụkwaghịm Minista Naịjirịa na-ahụ maka gburugburu bụ Ibrahim Jubril awụsala ọwa n'ọrụ ya, sị na ọ naghị arụzị. End of Twitter post, 1 Iwu ala machiri idina mmadụ n'ezi N'agbanyeghị akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na ọ dịghị n'iwu, kọmishọna ndị uweojii na Legọs bụ Edgal Imohimi, ekwuola na iwu Naịjirịa machiri nwoke na nwaanyị idina onwe ha n'ọha, ma kwuo na o nwere ike ịkpọga gị nga afọ abụọ na ụma. Na mba Brazil, Otu nwoke a kpọrọ Euler Fernando Grandolpho agbagbuola mmadụ anọ tupu ọ gbagbuo onwe ya n'ime ụlọụka Metropolitan Cathedral dị n'obodo Campinas. Ụlọụka Metropolitan Cathedral ebe a Grandolpho gbagburu mmadụ anọ N'egwuregwu, N'agbanyeghị na a na-enyocha ụfọdụ ndị na-akwado otu Chelsea maka ịkpaso onye egwu Manchester City bụ Raheem Sterling oke agbụrụ, ọ ka na-enwuke ka ugo. Ndị otu Premier League nyere Sterling nturuugo ""ọkachasị agba na Premier League nke ọnwa Nọvemba"" nke mere ya ugboro abụọ ọ na-enweta nturuugo a. Dike Igbo alaa mmụọ Ndị mmadụ apụtala ị kwanyere onye bụbu onyeisi Ohaneze Ndigbo nakwa dọkịnta amaama bụ Dozie Ikedife ugwu ikpeazụ n'ọnwụ ya. Dozie Ikedife dị afọ ira asatọ n'asatọ nwụrụ ụnyaahụ Ọzọ, Akwụkwọ udo ga-eme ka ndị na-azọ oche ọchịchị kwe nkwa na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi udo obodo na ntuliaka na-abịanụ Ndị mmadụ na-ajụ ebe Oby Ezekwesili, Donald Duke nakwa Atiku Abubakar bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nọ ụnyaahụ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nkwekọrịta udo maka ntụliaka 2019. Gụọ ya n'uju ebe a: Gịnị mere ahụghị Ezekwesili, Atiku n'ọgbakọ 'Peace accord'? Ndị otu MASSOB na-achọ ka gọọmentị etiti gere ha nti n'ọchichọ nwereonwe ha Uchenna Madu bu onye ndụ otu MASSOB apụtala ịkwu na o nweghi onye nwere ikikere ịgbochi ndigbo ịlaghachị ala Igbo maka ntụlịaka n'afọ 2019. Nke a na-abịa dịka otu akporo IDA n'aha ịchafụ nyere iwu na a ga-ada onye ọbụla nara ala Igbo, ọ kachasị ndị bi n'ugwu awụsa nha ma ha laghachị ala igbo na ntuliaka n'abịa. Na mba ofesi, Na mba ofesi ndị uweojii na mba Fransi na-achụ otu nwoke ji egbe wakpo ndị mmadụ n'ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg. Ha kwukwara na mwakpo a tara isi mmadụ atọ ebe mmadụ iri n'abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47744001,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47744001,2019 Election: INEC eforola ntutu taa n'isi Rochas Okorocha,Akụkọ dị mkpa:,"Inec eforola ntutu taa na ha enweghi ike inye Rochas Okorocha zọrọ oche sinetọ Ideatọ Saụt, asambodo mmeri ya. Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec, kwuru n'Ọka na ndị a ga-enye asambodo bụ ndị kwụwara aka ha ọtọ na ntuliaka. Ọnọdụ Donald Duke ugbua, Donald Duke enwetala mmeri n'ụlọikpe kacha elu na Naịjirịa, dịka onye ji ọkọlọtọ SDP azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019. Ugbọ ya gbara leti makana e mechaala ntuliaka ma họpụta onyeisiala, mana ụlọikpe nyere ikike sị ka a kwụọ ya nde Naịra atọ (N3m) iji tie ya aka n'obi. N'ofesi, Gawa agawa adịghị mma, lawa alawa adịghị mma. Dịka a na-ekwu, ndị omeiwu mba Briten ajụla itinye aka n'akwụkwọ ga-eme ka ha si mba UK pụọ bụ ihe a kpọrọ ""Brexit"". Ndị jụrụ ajụ ji vootu narị atọ na iri anọ na anọ (344) ebe ndị kwenyere na ha ga-apụ ji narị abụọ na iri asatọ na isii (286) maa afọ n'ala. N'egwuregwu, Ị ma na Iko asompi Uefa ga-awụchi Naịjirịa? Carlos Puyol gbaara Barcelona Bọọlụ bu ya bụ iko abịa njem nleta n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Epreelụ. Ya bụ iko ga-abịa ya bụ njem na Legọs nakwa Uyo. Ebonyi steeti, Odeakwụkwọ ukwu Inec Ebonyi Steeti bụ Andy Ezeani gwara BBC Igbo na Inec Ebonyi steeti ataala ụkwa jaa eze n'ihe gbara ntuliaka 2019. Oliver Osi onye nọchite anya ọgbọnta vootu Ivo ebe ọ na-etinye aka n'akwụkwọ mgbe ọ nwetere asambodo ya Inec nyere ndị meriri na ntuliaka 2019 asambodo ha iji wete ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị na njedebe. Mmeme a bụ nke naanị ndị omeiwu mmeriri bịara gara ụbọchị Tọzde. N'okwu ya, Andy Ezeani kwuru na ""ihe niile gara werewere mana Gọvanọ abịaghị"". Mgbe anyị jụrụ ya ka ọ bụ na Gọvanọ amaghị na a ga-enye asambodo ụbọchị ahụ, Ezeani zara na ""mgbe anyị ji nweta ikike n'Abuja ịme ya bụ ihe, anyị kpọrọ Gọvanọ Umahi bụ onye sị na ya anọghị na Naịjirịa mgbe ahụ, na ya gara ezumike n'ala Bekee."" Ezeani sị na a ga-enye Umahi asambodo nke ya mgbe ọ lọtara. Ahmadu Fintri nke PDP eturula ụgọ n'Adamawa Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec n'ịchafụ apọpụtala Ahmadu Fintri nke PDP dịka onye meriri mmeju ntuliaka e mere na Adamawa ụbọịchị Tọzde. Fintri onye meriri na ọnọdụ vootu 44 dị n'okpuru ọchịchị 14 ebe e mere ntuliaka ahụ meriri Bubrilla Bindow nke APC. O nwetara vootu 376,552, ebe Bindow nwetara 336,386 votes. N'otu aka ahụ, Abdulazeez Nyako gbara onye nke atọ dịka o nwetara 113,237. Cheta na Inec kwuburu na ntuliaka gọvanọ e mere n'abalị itoolu nke ọnwa maachị 'ezughị ịkpọpụta mmeri. Emume ụbọchị ọmụmụ Tinubu Ihe ọmụmụ Tinubu haziri maka ncheta ọmụmụ ya ụbọchị 28 nke ọnwa atọ n'afo 2019. Onyeisiala Muhammadụ Buhari abịaghị emume ncheta ọmụmụ Ahmed Tinubu agbanyeghị na e butere ya n'Abuja. Ntuliaka Adamawa N'Adamawa Ahmadu Fintiri nke PDP ewerela vootu dị puku narị atọ na iri asaa na isi na ụma (376,552) merie Jibrilla Bindow nke APC nwere vootu pụkụ narị atọ na iri atọ na ụma (336,386). Gonzalo Higuain awusala ọwa Gonzalo Higuain Gonzalo Higuain awụsala ọwa n'ihe gbasara ịgbara ndị mba Ajentina bọolụ. Higuain dị afọ iri atọ na otu kwuru na ọ chọrọ igbado anya n'ịgbara Chelsea bọọlụ ugbua. Gee nkeji Igbo ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị ebe a Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo. Akụkọ ga-amasị gị" afirika-46773263,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46773263,Daily Trust: Ndịagha Naịjirịa agbachiela ụlọọrụ ha abụọ,Akụkọ dị mkpa,"Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ ndịagha Naịjirịa awakpoola ụlọọrụ ndị ntaakaụkọ Daily Trust nke dị na Borno steeti. E kwukwara na anwụchiri onyeisi ha bụ Uthman Abubakar nakwa otu onye ntaakaụkọ bụ Ibrahim Sawab. N'otu aka ahụ ndịagha Naịjirịa gakwara n'ụlọọrụ ha nke dị n'Abuja kwakọrọ ngwaọrụ ha ma gwa ndịọrụ niile ha gbadaa n'ala n'ụlọ ebe ụlọọrụ ha dị. Otu onye n'ime ha achọghị ka a mara aha ya gwara BBC n'ekwentị na ndịagha nwuchiri mmadụ abụọ n'ime ha. O kwuru na o nwereike ị bụ maka akụkọ ha dere taa gbasara ọrụ ndịagha na etu o si aga n'ugwu awụsa Naịjirịa. ""Anyị na-agbalị ịnweta ndịagha n'ekwentị ịjụ ha ihe anyị mere ha jiri gbachie ụlọọrụ anyị mana ha ekweghị aza anyị"" bụ ihe o kwukwara. BBC na-agbalịkwa ịnweta ndịagha nụrụ olu ha gbasara okwu a mana o nwebeghị isi. Ọzọ, Ndịuweojii n'Ogun steeti anwụchiela ụmụnwoke anọ bụ ndị bu egbe aga ohi n'ụlọụka dị icheiche na gburugburu steeti ahụ. Na mba ofesi, Dịka agbachiri isiụlọọrụ gọọmentị mba Amerịka, onyeisiala ahụ bụ Donald Trump ka kwụsike na-ekwu na ọ gaghị agbanwe uche ya gbasara ịrụ aja ga-ekewa oke mba Amerịka na mba Mexico N'egwuregwu, Amaju Pinnick bụ onye ndu otu egwuregwu bọọlụ Naijiria ekwuola na ha ga-akwaod ịzute onye ọgba bọọlụ bụ Victor Moses iji nwee nzụkọ ga-eme ka o si n'ezumike ọ bara laghachite n'ịgbara Naịjirịa bọolụ Akụkọ BBC Igbo na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Onye na-azọ oche osote onyeisiala n'okpuru ọchịchị pati PDP bụ Peter Obi ekwuola mkpa ọ dị iwere akụ na ụba Naijiria dozie ndụ ụmụ Naijirịa. O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'ụlọụka "" House on the rock"" dị na Lagos. Obi kwuru na ụmụ Naịjiria enweghị obodo ọzọ ma ọbụghị Naijiria ma rịọkwa ka Chukwu metụ obi ndị nọ n'ọchịchị aka ka ha mee ka ihe dịrị ụmụ Naịjirịa mma. O kwuru ka onye ọbụla bụ onye Naịjiria na-kpere obodo a ekpere. Na ngwucha, Obi kwuru na ọ bụrụ na ndị ọchịchi wulite Naijirịa, ụmụ anyị na-abịanụ ga-eri uru ya kwa mgbe kwa mgbe. Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee ewepụtala ụbọchị Jenụwari iri, dịka ụbọchị ụmụ Naịjirịa ga-ekpe ekpere maka ntuliaka kwụ ọtọ nke ga-eme n'afọ a nakwa ntọghapụ Leah Sharibu. Samson Olasupo Ayokunle onye degara ndị ntakụkọ ozi a kwuru na emume a ga-enye ụmụ Naịjirịa ohere iji rịọ chukwu ka onye ha ndị ọchịchị dịmma ma na-atụkwa egwu Chineke. N'akụkọ ọzọ, Otu onye so chọpụta otu ""Arewa consultative forum"" bụ Tanko Yakassai ekwuola na ndịIgbo agaghị enweta oche onyeisiala ruo afọ iri abụọ na asatọ, maọbụrụ na onyeisiala Muhammadu Buhari merie na ntuliaka 2019. Yakassai gwara ndị ntaakụkọ SUN mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ. N'ofesi, Mba Saudi Arabia ewepụtala iwu ga-enye ụmụnwaanyị mba ahụ ikike ịmata mgbe dị ha gbara ha alụkwaghịm n'ụlọikpe. Tupu ugbua ụmụnwoke mba ahụ na-agba nwunye ha alụkwaghịm na nzuzo n'agwaghị ha agwa. Cheta na otebeghị aka mba ahụ nyere ụmụnwaanyị ha ikike ịnya ụgbọala kamgbe amachiri ha ruo afọ iri. N'Egwuregwu, Kamgbe akụkọ pụtachara na ọgba bọọlụ Super Igụlụ bụ John Mikel Obi ahapụla otu egwuregwu China akpọro Tianjin Teda n'anọzughi oge ya na kwekọrịtara na ọ ga-anọzu, ndị mmadụ na soshal media atụwarala ya alo otu egwuregwu bọọlụ ọ ga banye ọzọ ebe ụfọdụ gwara ya lata bara otu egwuregwu Naijirịa uru. @ScottEaglen na-arịọ ka ọ gawa West Ham. @Isa_Babagana kwuru ka ọ lawa Naijirịa ga nọnyere otu na-ekpokọta ndị bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ bụ Nigeria Professional Football League(NPFL). Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ihe dị iche n'Ozalla" afirika-47637296,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47637296,Ndị uweojii anwụchiela nwoke ji $20m abụghị ezi ego,Akụkọ mbụ,"Ndị uweojii na mba Kenya anwụchiela mmadụ isii n'ime ụlọakụ Barclays maka ego abụghị ezigbo ya. Onyeisi ndị na-eme nyocha kwuru nke a site n'akara Twitter ma kwuo na ọ bụ n'ime ụlọakụ ahụ ka achọtara ego adigboroja ahụ. Ụgwọ opekatampe Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Ndị Anambra steeti ga na-enwe onwe ha n'ọṅụ ugbua gbasara ụgwọ opekatampe ọhụrụ. Ha gwara BBC Igbo na ha ga-abụ ndị mbụ ga-akwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ bụ puku naịra iri atọ. Gịnị na-eme na Bauchi? Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka Akụkọ na-ekwu na Inec ekpegharịala iwu otu ụlọikpe n'Abuja nyere iji kwụsị ngụkọ vootu a na-eme na Bauchi steeti. Ngụkọ a na-agụkọ bụ nke ntuliaka ọkwa gọvanọ nke e mere na satode abụo gara aga. Na mba ofesi, Ndị obodo Acipayam na mba Turkey ga-achị obi ha n'aka ugbua n'ihi ala ọma jiji mere n'obodo ahụ. Mmadụ atọ merụrụ ahụ n'ihe a ebe ụfọdụ ụlọ obibi dara ada. Amabeghi ma o nwere onye nwụrụ ebe ahụ. N'egwuregwu! Otu ""Super Eagles"" nke Naijirịa ebidola ọzụzụ ha ta n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi nke dị n'Asaba ebe otu obere nke akpọrọ ""Dream Team"" na mba Libya na-achịpụ ya iji zọta ọnọdụ n'asọmpị iko mba Afịrịka. Mana ndị Libya mechara merie ndị ""Dream Team"". Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Atiku sị na ya meriri Buhari Atiku Abubakar nke PDP ekwuola na nchọpụta ya mere na ikwe kọmpụta ndị Inec gosiri na ya ji ihe karịrị otu puku vootu merie Muhammadu Buharị na ndọrọndọrọ onyeisiala e mere n'ọnwa Febuwarị. Nke a dị n'akwụkwọ Atiku gbara Inec, APC na Muhammadu Buhari bụ n'ụlọikpe ndọrọndọrọ ọchịchị nke ndị isiala dị n'Abuja. Obino na-eche echiche ịmachi ahịa mbughari Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obialo ekwela nkwa na gọmenti ya ga-akwu ụgwọ ụlọọgwu ndị meruru ahụ na ihe mberede okporo ụzọ n'Umuchu bụ ebe trailer ọzọ dabara n'ụlọ ahịa ndị mmadụ ma meruo ọtụtụ ndị ahịa mbugharị ahụ. Obialọ kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta ndị ya bụ ọdachị dagidere bụ ebe ọ nọ rutu aka ịmachi ahịa mbugharị na steeti ahụ. Ihe mberede a mere n'otu ụbọchị nke mere Ọnịcha mere bụ ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Maachị afọ 2019. Iji ọgwụ agbagbu ahịa n'ubi Ọrụụbi ebidowela ọtuụtụ ebe n'alaigbo Ngwa elenụ anya o, Ụlọikpe na San Fransico, US, achọpụtala na ụmụ ọgwu a eji egbụ ahịhịa n'ụgbọ so ebute ọrịa Kansa ebe otu ndị na-arụpụta ya bụ ọgwụ, bụ Bayer na-agọ ụkwụ na aka. Ndị ọrụubi, ọma akwa asahụ mara onwe ya o. N'egwuruegwu Ndị egwu bọọlụ Naịjirịa Ụmụ Naịjirịa asọmmpị na-adị mma arịọla otu Super Eagles ka ha tinye uchu na asọmmpị ha na ndị Seychelles, agbanyeghị na ha agaferela na otu ha dị ka ndị ga-eso zọọ iko mba Africa na bịanụ. Ndị niile atụrụ anya ga-eso gbaa sọọ ya bụ mpị ezuola na ọgbọ egwuruegwu dị n'Asaba. Gee nkeji anyi ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri anyị Childbirth: Lee obodo anaghị ekwe nwaanyị dị ime mụọ nwa Akụkọ ga-amasi dị" media-46698887,https://www.bbc.com/igbo/media-46698887,Shehu Shagari: Ọnwụ akpọrọla onye bụbu onyeisiala Naịjirịa,Akụkọ dị mkpa taa:,"Shehu Shagari chịrị Naịjirịa site n'afọ 1979 ruo 1983, anwụọla ka ọ rịachara obere ọrịa. Shagari dị afọ 93 oge ọ nwụrụ. Nwa nwa ya bụ Bello Shagari, kwuputara nke a n'elu Twitter ya, ka o kwuru na ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'Abuja. Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Bashir Ahmad kwukwara maka ọnwụ ya na Twitter ya, ebe o kwuru ka Chineke nara obi ya na ndokwa. E jiri 'Green Revolution, ịrụ ụlọ a na-esi mmanụ agbịdị bụ 'Kaduna Refinery,' mara ọchịchị ya nke Muhammadu Buhari dịka onye agha nara ya ọkwa n'ike n' abalị 31 nke ọnwa Disemba afọ 1983. Buharị chọrọ ka ị tụkwasị ya obi: Ka ndị otu APC gara achụmnta vootu n'Akwa Ibom steeti, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru maka usoro o ji achụ mpụ na nrụrụaka. O kwuru sị ""Oge m bụ onye agha, anyị na-anwụchi ndị mmadụ kpọchie maka nrụrụaka ruo oge ị gosiri na aka gị dị ọcha. Mana ugbua m na-eyizi akwa agbada, ana m esozi ya n'usoro ọchịchị onyekwuo uche ya. Anyị na-eme ya, anyị agaghị akwụsị. Anyị anapụtala ụlọ nakwa ego."" Ọ gara n'ihu kwuo sị ""Ị gaghị ata onwe gị ụta maka ịtụkwasị anyị obi. ""Daalụ Akwa Ibom. Enweghị onye Naịjirịa ga-ata onwe ya ụta maka itunyere anyị vootu. Anyị ga-agbado anya na nchekwa, akụnaụba obodo nakwa ibuso mpụ na nrụrụaka agha. "" N'Imo steeti, Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwoke a kpọrọ Uchenna Nwachukwu, bụ onye ha na-ebo ebubo maka ịtọrọ ọkaiwu Bidwell Onyekasi, n'Owere. Onye a tụrụ ịga Kọmishọna uweojii steeti ahụ bụ Dasuki Galadanchi, kwuru na onyeisi otu F-Sars bụ Geoffery Victor, nwụchiri Nwachukwu nso ụlọakwụkwọ Emmanuel College. N'akụkọ ọzọ, Akụkọ si obodo Baga dị na Borno steeti apụta na-akọwa na Boko Haram ewerela ọnọdụ dịka agada gbachiri ụzọ n'obodo ahụ. Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị Akụkọ na-ekwukwa na ha buruchara ngwaagha nakwa ụgbọala ndị agha Naịjirịa ma gbaa ebe na-anọ ọkụ. Na mba ofesi, Mba Kongo enyela onye nnọchite Yurop abalị abụo ka o si n'ala ha pụọ. Nke a bụ iji bọgwara otu jikọrọ mba nọ na Yurop ụbọ maka imachị ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ndị gụnyere onyeisiala ha bụ Joseph Kabila na onye bụbụ mịnịsta ihe na-eme n'ụlọ bụ Ramazani Shadary bụ onye na na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ehighariiri. Otu EU katọrọ nyigharị ahụ sị na o kwesịghị ekwesị. N'akụkọ ọzọ, Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ọ ga-emechi okeala jikọro Amerịka na Mekziko maọbụrụ na ụlọomeiwu jụ iwepụta ego ọ ga-eji rụọ mgbidi aja ọ chọrọ ịrụ. O dere na Twitter sị ""ọ ga-aka mma na anyị wuru mgbidi aja maọbụ anyị emechie okeala. N'egwuregwu, Ọ ga-akpọtụ akpọtụ na Premier League na satọde mgbe Liverpool ga-ezute Arsenal. Onye ga-ezu ibe ya ike n'ahụ? Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivers steeti gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha anwụchiela nwoke ahụ. Ọ sị na ọ bụ mgbe nwoke ahụ na nwunye na-ese okwu ka ọ bulitere ya bụ okwute tụọ nwaanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịgbalahụ di ya. ""Nwaanyị ahụ dị ime dara ma kubuo tupu enyemaka abịara ya"" ka o kwuru mgbe a jụrụ ya. O kwukwara na ozu nwaanyị ahụ dị n'ụlọozu ugbua dịka ndị uweojii na-akwado ịme nyocha chọpụta ihe gburu ya n'ezie. Ndị echere na ha gbaguru Alex Badeh akwọwala ihe mere ha jiri gbuo ya. Ha kwuru na ọ bụ mgbe ha na-achọ izu nnukwu ego ha nụrụ na o bu ka ha gbagburu ya. Mana ụlọ ntaakụkọ NAN depụtara na ezinaụlọ Badeh ekwetaghị na ya bụ akaebe. Ha kwuru na Badeh ejizughi naịra narị ise mgbe o si n'ụlọ ya pụọ n'ụbọchị ahụ. N'akụkọ ọzọ, PVC ndị anatabeghị Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n'Oyo steeti ekwuola n'ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwanye ọkụ n'ike ha resi ha PVC nke ndị mmadụ anatabeghi Mana ha kwuru na ha kwụsiri ike na ntụlịaka 2019 ga-abụ ihe kwụọtọ. Na mba Ofesi, Ndị na-eme ngagharị iwe n'obodo Kongo awokpola ụlọ ebe a na-agwọ ma na-enyocha ọrịa ebola. Iwe ha bụ maka ndọtị adọtịrị ntuliaka n'ala ha dịka ngalaba na-ahụ maka ya bụ ntụlịka kwuru na ọ bụ ịgbochi ọrịa ebola mere ka ha dọtịa ya bụ ntuliaka. N'egwuregwu, Serena Williams kwuru na ya na-ebu agha a maka ụmụnwanyị niile Serena Williams bụ odogwu n'ịpịa Tennis ekwuola na ọ ga-agbado anya n'ihe dị mkpa nakwa ọdịnihu ya dịka nwanne ya nwaanyị bụ Venus Williams meriri ya n'asọmpị ha pịara na Abu Dhabi Okwu ahụ bụ iji kọwa ihe mere mgbe Naomi Osaka meriri ya n'asọmpị US Open n'ọnwa September Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45967479,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45967479,Port Harcourt Airport: Agbapeela ụlọ nlabata ọhụrụ,Akụkọ dị mkpa taa,"Mgbape ọdọụgbọelu na Portharcourt Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ndị chịburu achị mara afọ n'ala na nwulite ọdọụgbọelu na Naịjirịa kamgbe afọ 1980. O kwuru nke a mgbe ọ na-agbape ngalaba ọhụrụ nke ọdọụgbọelu mbaụwa dị n'Omagwa Portharcourt nke Rivers Steeti taa. Okorocha a saala APC Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onye odeakwụkwọ mgbasa ozi pati APC bụ Lanre Issa Onilu ezipụla ozi ọjọọ banyere APC na mbaụwa. Okwu a bụ na nzaghachị okwu Issa kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ APC anabataghị mmeri e meriri ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na nso nso a. N'ofesi Ezigala ozi ogbunigwe ọzọ n'ụlọ oriri Tribeca Grill dị na New York nke onye nwe ya bụ De Niro. Nke a bụ mmadụ itoolu ndị akụkọ kwuru na-akatọọ ọchịchị onyeisiala Trump a na-ezigara ụdị ozi a n'ime otu izuụka. N'egwuregwu N'asọmpi Europa nke abalị a Sporting Lisbon ga-ele Arsenal ọbịa, ebe Chelsea ga-anabata ndị Bate Borisov. N'aka nke ọzọ Zenit St Petersburg, Dinamo Zagreb, Bayer Leverkusen na ndị ọzọ ga-anọ n'egwu. Nkeji abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ Gọọmentị etiti ekewapụtala ego ruru tarịị naịra asatọ n'ọma bu ego a ga-emefu n'afọ 2019 dịka bọjeti. Minista na-ahụ maka nhazi nakwa bọjeti bụ Udoma Udoma ekwuola na ya bụ akwụkwọ na-aga n'ụlọomeiwu maka nyocha ugbua Minista na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed etiela mkpu n'akụkọ na-agagharị na-ekwu na ya ndị mba Israel na-ama aka gbasara Nnamdi Kanu abụghị eziokwu. Ọ sị na ndị ọ gbasara ga-ezi ozi n'okwu Nnamdi Kanu ma oge ruo. Na mba ofesi, Mba Saut Afrịka ewepula ụgwọ ụtụ isi dị n'elu akwa ụmụnwaanyị ji anọ na nsọ iji nyere nwata akwụkwọ ndị nwaanyị aka ka ha kwụsị ịgbajọ ụlọakwụkwọ. Cheta na ụfọdụ ndị ntorobia na Naịjirịa na-akpoku gọọmentị etiti oku ka ha wepu ya bụ ụtụ isi. N'Egwuregwu, Otu egwuregwu Rangers abụrụla aha na-ewu ewu ugbua dịka ha meriri Kano Pillars n'Asaba ụnyaahụ iji buli asọmpị iko FA nke mbụ ha n'afọ iri atọ n'anọ Ndị kpara ike a bụ Kelvin Itoya Chidera Ezeh Ajani Ibrahim na n dị ọzọ. Gee Nkeji nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Hyperrealism: 'A na m ese ihe maka ndụ ndị nnanna anyị'" afirika-45094962,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45094962,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Onye ntọ ejirila Tramadol ṅụtara onwe ya nsogbu,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ihe ntọ ọchị Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara Ụwa emebiela o! Onye bịara ịtọ mmadụ emeela ihe a ga-eji cheta ya. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo steeti kwuru na ha nwụchiri ya bụ onye ntọ ka ọ rahụfuru ụra n'ụlọ onye ọ bịara ịtọ maka na ọ ṅụrụ ọgwụ tramadol. Ndị si APC na PDP pụọ a nọ na nsogbu? Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed, ekwuola sị na ndị si otu pati gafee ọzọ mara na ha agaghị agbanarị ikpe ma ọ bụrụ na enyochapụta mmerụaka n'aka ha. O kwukwara na gọọmentị etiti ka na-enyocha ebubo e boro Kemi Adeosun bụ minista na-ahụ maka akụnaụba, maka asambodo adịgboroja. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ikpe ga-ama onye ikpe ga-ama' - Lai Mohammed Na mba ofesi, Onyeisiala ndị Ivory Coast bụ Alassane Ouattara, etiela iwu iji gbaghara Simone Gbagbo bụ nwunye onye chịburu mba ahụ. Cheta na Gbagbo gara nga mkpụrụ ọka ebe ọ kwesịrị ịnọ afọ iri abụọ maka itinye ọnọdụ nchekwa steeti na nsogbu. Iwu a kwuru ka a tọghapụ ya na mmadụ narị asaa na iri itoolu na itoolu ndị ọzọ. N'egwuregwu, Thibaut Courtois bụ aka na-echere Chelsea goal ọ ka ga-agbara ha? Enwebeghị onye ma ọnọdụ ya maka ihe o mere ụnyaahụ. Courtois bụ onye ndị mmadụ na-eche ịnụ ma ọ ga-agafe Real Madrid, esoghị ndị otu ya mee nkwado ha mere. Nkeji ụtụtụ taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Ikechukwu Uche kwuru na obi dị ya ụtọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ. Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ" afirika-45539132,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45539132,"HSBC: Buhari chịa ọzọ, ọ ga-emetụta akụnaụba Naịjirịa",Akụkọ gbapụtara ihe taa,"Ihe mberede okporụzọ egbuola mmadụ anọ n'Enugwu Ifeanyi Okorie Taa bụ ụbọchị akwa dịka ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ anọ na Nkwe, n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu steeti. Mmadụ anọ ahụ gụnyere ọkwọụgbọala na ụmụnwaanyị atọ ndị ọzọ gara ịzụta ahịa n'ime obodo ahụ. Kwụsị ịkwado ndị ohi na Naịjirịa - Gọọmenti Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ụlọakụ ukwu na mbaụwa bụ HSBC n'ịchafụ maka amụma ha buru na nhọpụta Buhari ọzọ ga-ala akụnaụba Naịjirịa n'iyi. Ha gara n'ihu kwuo na ụlọakụ a na-enyere ndị mmadụ aka izu akụnaụba Naịjira ka ha gbaa mbọ weghachị ego Naịjirịa e zuru bụ nke dị n'aka ha. Ihe oke ifufe akpọrọ Florence na-eme n'Amerịka nakwa ihe'Typhoon' na-eme na China Na mba ofesi, oke ifufe na mmiri nke Florence zutere Nọt Karolina ebelatala mana a na-ekwu na idemmiri ya nwereike iba obodo ndị ọzọ. Ya bụ mmiri ozuzo jizi nwayọọ aga mana ọ na-echezi ihu na steeti Ohio N'aka nke ọzọ oke ifufe na mmiri ozuzo jikwa mba China n'ọrụ dịka a na-ekwu na nke a bụ ebili mmiri kachasị zutere ha. N'egwuregwu N'egwuregwu, nwa Kenya bụ Eliud Kipchoge adọkala akwụkwọ ndekọ n'egwuregwu ịgba ọsọ maratọn na Berlin taa, ebe o ji nkeji iri atọ na itoolu belata oge e ji agba ya bụ ọsọ. N'aka nke ọzọ, ọgba bọọlụ Christiana Ronaldo enyela goolu mbụ ya n'otu egwu bọọlụ Juventus bụ ndị goro ya ọhụrụ. Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Mmepe ụlọọrụ PDP n'Anambra Steeti Ndị uweojii e mepeela ụlọọrụ pati PDP dị n'Anambra steeti bụ nke ha mechiri n'ihi ọgbaghara dị bu n'etiti ndị pati ahụ. Ha mere nke a mgbe ndị PDP na komishiona ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nwere mkparịta udo. Na mba ofesi Ihe ruru mmadụ iri na otu anwụọla na mba Amerịka n'ihi oke ifufe 'Florence' nakwa idemmiri nke n'akpa ike n'obodo Karolina. N'otu aka ahụ oke ifufe akpọrọ Typhoon Mangkhut ataala isi mmadụ iri abụọ na otu na mba Philipines dịka otinyela isi na mba China. N'egwuregwu Otu Golden Eaglets nke Naịjirịa jiri penariti ọkpụ atọ asatara otu merie ndị Black Starlets nke Ghana n'asọmpi ikpeazụ WAFU. Mmeri a bụ nke mere ha itozuoke n'asọmpi Iko mba Afrịka ndị n'okpuru afọ iri na asaa. Nkeji ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Kofi Annan" media-50114920,https://www.bbc.com/igbo/media-50114920,Davido New baby: Nwaanyị ọ chọrọ ịlụ amụọlara ya nwa 'agbaagba' nwa nwoke,Ure nwa ooooo!,"Davido etiwasala akụkọ ahụ ụmụ ụwa na-eche kamgbe. End of Instagram post, 1 Cheta na oti egwu ama ama dịka Davido(David Adedeji Adeleke) depụtara ọsịsa o nyere onye na-ajụ ya maka egwu ọ ka na-etipute etipute, ndị mmadụ buru okwu ahụ gawa ""ụlọakụ"". Ọtụtụ ụmụ Naịjiria bidoro kelewe Davido makana ha chere na ọ bụ ọmụmụ nwa Chioma(onye ọ chọrọ ịlụ). Mana n'oge na-adịghị anya, Davido depụtara na David nke obere awụchiela ma tokwa nwunye ya bụ Chioma, na-ekwu na o siri ike. Lekwa ụfọdụ ekele ụmụ Naịjirịa bunyere Davido ka o depụchara na nwunye ya amụọla nwa. @_omoissy kwuru na ọ nọ na-eche akụkọ ọma kamgbe elekere iri na otu nke abalị fotere taa. @Amchizzy kelekwara ya. @Real_jaeflex na-ekpere ha ekpere ọma. @@PluckyPrecious kelere Davido maka etu o si kele nwunye ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị ""Igbaji ụkwụ emeghị m onye arịrịọ""" afirika-44559529,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44559529,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mba Afrịka abụọ apụọla n'asọmpị iko mbaụwa,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ndị uweojii achọtala ogbunigwe n'isi ụlọọrụ otu PDP na abakaliki nke butere nzụkọ gbata gbata n'etiti gọvanọ Umahi na ndị isi ọrụ nchekwa Umahi kwukwara na ọ ziela ndị nchekwa ha mee nyocha zuruoke gwa ndị isi ha ebe ọ ga ezigara onyeisiala okwu maka ihe a mere. OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma Mahadum Obafemi Awolowo achụọla onye nkuzi chọrọ ị dina nwata akwụkwọ ya tupu ọ gafee ule ya. Nke a bịara mgbe nyocha Mahadum ahụ mere gosiri na nwata akwụkwọ ahụ gafere ule ya. Ha kwuru na ha na-eme ihe ịhụ na akwụsịrị ndị nkuzi ị dịna ụmụakwụkwọ kpam kapm. Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ebinyela aka n'iwu pụrụiche kwuru na agaghị ekewa ezinaụlọ ndị mbịara mbịara na-achọ ị bata Amerịka O kwuru na ihe kachasị mkpa bụ nnọkọ ezịnaụlọ na nchekwa oke Amerịka na mba ndị ọzọ N'egwuregwu, Spen ji otu ọkpụ merie Iran ụnyaahụ ebe e wepuru goolu Iran nyere na agba nke abụọ. Ajentina na-akwado ị zute Kroeshia taa ebe Fransi na Peru ga-asọmpị ebe elekere anọ nke ehihie. Ihe ndi ọzọ ị kwesiri ị ma Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputala na anya edoghi ya n'akwụkwọ bọọjetị 2018 nke o binyere aka na ya ụnyahụ. O kwuru na o nwere ụfọdụ ego ndị ụlọomeiwu ukwu gbanwere tupu ha nye ya ya bụ bọọjetị. Ọ kọwara ya n'ozi ọ gbasara site n'akara soshal midia twita ya Gee nkeji nke ụtụtụ ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe Yul Edochie kwuru gbasara ndị ntorobia na-akwado ị zọ ọchịchị Yul Edochie" afirika-44763691,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44763691,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: FIFA ga-enyocha Vida maka okwu megidere Rọshịa,Akụkọ ndị dị mkpa,"Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Onyeisi ndị ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki ga-akpọrọ ndị otu ya ndị ọzọ gaa njem nleta n'ụlọ ndị omeiwu mba Amerịka taa. Ihe ndị ha ga-arụtụ aka na njem a gụnyere nwulite mmekọrịta ndị omeiwu na usoro ọchịchị mba Naịjirịa na mba Amerịka. Ebe ọzọ na Naịjirịa Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola n'onweghị oke ala ha nwere maka ọrụ ngo ma ọfụdụzie ogbe ebe a na-azụ ehi Okwu nke a bụ ihe pụtara na-akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Dave Umahi wepụtara n'ime mkparịta ụka ha mere ụnyaahụ. Na mba ofesi, E chere na mmadụ ruru otu narị anwụọla ebe iri na ise na-efu efu na mpaghara ọwụwa-anyanwụ mba Jaapan n'ihi oke mmiri ozuzo nke butere oke idemmiri. Mmiri ozuzo a malitere kamgbe abalị ise gara aga ji ugboro atọ karịa etu mmiri si ezo n'ebe ahụ n'ime ọnwa Julaị. N'Egwuregwu FIFA ebidola ime onye ọgba bọọlụ mba Kroeshia akpọrọ Vida nyocha maka okwu megidere mba Rọshịa o kwuru n'ihe onyonyo. N'otu aka ahụ ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Brazil adọọla ndị Brazil aka na ntị maka ị kpa oke agbụrụ megide onye otu egwurewgwu ha bụ Fernadinho maka ọkpụ o nyere megide ha n'asompị iko mba ụwa. Gee akụkọ ndị mere taa n'ịchafụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Illbliss maka Biafra." afirika-47479349,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47479349,A ga-akwụgbu onye nkuzi 'pịagburu' nwata akwụkwọ,Akụkọ dị mkpa:,"Na mba Tanzanịa, a ga-eji ụdọ akwụgbu onye nkuzi tiri otu nwataakwụkwọ ya ihe tinka kụrụ pan, mere ka ihe mgbu o nwetara n'otiti ahụ gbuo ya. Onye nkuzi ahụ dị afọ iri ise na otu, boro nwata ahụ dị afọ iri na anọ ebubo izu akpa otu onye nkuzi. N'agbanyeghi na ntaramahụhụ dịka ịkwụ mmadụ ụdọ ma o mete ihe e ji eme ya dị ire na mba Tanzanịa, nke a ga-eme ya mbụ a ga-eme ya mmadụ kemgbe 1994 e mere ya ikpeazụ. Uche Nwosu ọ na-azọ ka ọ naghị azọ? Ọnụ na-ekwuchitere Uche Nwosu bụ Onwuasoanya FCC Jones, ekwuola na akụkọ na-efegharị na Nwosu agaghị eso azọ oche gọvanọ n'Imo steeti, bụ akụkọ ụgha. Gụọ ya n'uju ebe a: Akwapụla Uche Nwosu ịzọ ọkwa gọvanọ na Satọde ? A na-agbazị egbe n'Imo? Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị Ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala onye na-achụrụ Emeka Ihedioha bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati PDP n'Imo steeti nta vootu, egbe. Dịka anya hụrụ ka o si mee bụ Eze Ugochukwu gwara BBC Igbo, nwaamadị a bụ Nsorom Nnamdi, natara ọnụ egbe abụọ site n'aka ndị Ojiegbe a bụ ụmụokorobịa abụọ ji ogbatumtum. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Egbe agbawala n'Imo steeti N'egwuregwu, A ga-anụ ụzụ Chelsea, Arsenal, Inter Milan, Sevilla, Valencia, Dynamo Kiev, Benfica, Napoli na ndị ọzọ, na mgbede a mgbe Europa League malitere. Ọ bụ Lukaku nyere Manchester United goolu nke mbụ n'asompi ha na PSG mere n'abalị Wenezde ngwagwa e bidochara asompi ahụ na ntabianya 111. Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG Lukaku mechara nyekwa goolu nke abụọ ya ka n'oge agba nke abụọ. Cheta na PSG gbaburu Man.U ọkpụ abụọ n' ụlọ ha izuatọ atọ gara gara a. Mana Manchester United mere PSG 'ọgbara Igbo gharịị' n'ụlọ ebe ha dịka ha ji ọkpụ atọ a satara otu merie ha Ọ bụ Marcus Rashford gbara penarịtị nyere goolu gbakara netị nke ndị PSG nke tiri Neymar e cheta ebewe. Neymar Da Silva Santos onye gosiri iwe ya na soshal midia kwuru n' igwe Instagram ya na penarịtị a gbara ha abụghị ya mana o mechara wepụ ozi ahụ. Election 2019: Atiku enwetala ikike ịnyocha akụrụngwa Inec Atiku Abubakar nke PDP emeriela agba nke mbụ dịka ụlọikpe ehiwere gbasara ntuliaka nọrọ nye Inec iwu ka ha nye ya na otu PDP ikike inyocha akwụkwọ na akọrọngwa ntuliaka ọkwa onyeisiala nke a mere n' abalị iri abụọ na atọ ọnwa Febụwarị afọ 2019. Mana na mkpebi ha n'Abuja ụbọchị Wenezde, ndị ọkaikpe atọ lekọtara okwu ahụ bụ Abdul Aboki, Peter Ige nakwa Emmanuel Agim ekweghị ka o mee nyocha pụrụ iche na ya bụ akọrọnwga ""ugbua"". Ihe ndị e nyere ha ikike ilebanye anya gụnyere igwe ""card reader"",akwụkwọ ndekọ nakwa ndị ọzọ. Ọzọ, Onyeisi Inec na Imo bụ ọkammụta Francis Ezeonu ebola ebubo na ndị ọrụ ngo Inec n' Imo na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kpakọrọ nkata wụnye aja na garị na ntuliaka ọkwa onyesisiala nakwa nke ụlọoimeiwu titi e mere. Lee akụko yiri ya ebe a. Ibeawuchi Na mba ofesi, Ụlọọrụ mba China na-emepụta ekwentị bụ Huawei agbaala gọọmenti mba Amerịka akwụkwọ maka ịmabido ngwa ahịa ha dịka Amerịka na-ebo ha ebubo inyo ndị mba ha n'ụzọ ezịghị ezi. Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG" afirika-44909826,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44909826,Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ: Enugwu steeti amapụtala 400m iji rụọ ụzọ,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ifeanyi Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu steeti Gọọmentị Enugu steeti amapụtala ihe karịrị naịra nde narị anọ iji hibe ngalaba dị icheiche na steeti ahụ Ọrụ ndị a ga-amalite gụnyere ụzọ itoolu ọhụrụ n'ime steeti ahụ iji mee njem mfe ma kwụsịkwa ahịrị ụgbọala. Atiku so na ndị gwuzobere APC A na-anụ kepu kepu na taa bụ ụbọchị Atiku Abubakar bụ bu osote onyeisiala ga-ekwuputa na ọ ga-azọ ọkwa ọchịchị site n'otu PDP Dịka o deputara n'akwụkwọ ozi, o okwuru na ihe oji pụta ịzọ ya bụ ọkwa bụ oku ụmụ Naịjirịa na-akpọ maka ị hazi akụnaụba obodo ma wepụtakwa ọrụ dị icheiche. Osinbajo jiri ụgbọala laa ka ọ kagburu njem ya. Osote onyeisial enyela iwu ka-eme mkpocha gwongworo n'ụzọ Oshodi-Apapa n'ime abalị atọ. O kwuru nke a mgbe ọ bịara na Legọs hụ ọnọdụ ụzọ ahụ mere mkpọchi site n'ahiri ụgbọala. Ụfọdụ mmadụ tọrọ atọ n'ahiri ahụ kemgbe ehihie Fraide. Ihe na-eme N'Afrịka, Ndị uweojii n'obodo Galilee n'ọdịda anyanwụ Ethiopia anwụchiela otu onye amụma kwuru na ọ ga-esi n'ọnwụ kpolite otu nwoke nwuru anwụ ebe ahụ. Getayaukal Ayele zigara ezinaụlọ onye ahụ ozi Lazarus nwụrụ na akwụkwọ nso tupu ha-ekwe ya gbalia ị kpọlite nwoke ahụ nwụrụ kemgbe abali anọ. N'egwuregwu, Naịjirịa, Igipt, Moroko, Tunisia na Senegal ga-enwe nzụkọ taa na ala Morocco iji chọpụta ihe mere eji gbapụ ha n'agba nke mbụ n'asọmpị ikombaụwa. Ọ bụ ndị ọrụ ngalaba bọọlụ mba ndị a na ndị nkuzi otu egwuregwu ha ga-anọ na nzụkọ a. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-43508053,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43508053,Oke ụgwọ ọnwa gị oruru nke Sịnetọ?,Etu e si eme ya,"Denye ego ole a na-akwụ gị n'ọnwa n'ime ihe eserese a. Otu sinetọ Naịjirịa na-erite ihe ruru nde 156 kwa afọ. Ọ bụrụ na ị na-erite ụgwọọnwa ọpekata mpe (₦18,000): Ọ bụrụ na ị na-erite ₦50,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦100,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦150,000: Ọ bụrụ na ị na-erite ₦200,000: Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a Kekọrịta ihe pụtara Kekọrịta peeji a kamgbe ị nọ na peeji a onye mere ya Etu e si eme ya Ihe e ji mee atụmatụ ụgwọọnwa ndị sinetọ sitere n'okwu Sinetọ Shehu Sani kwuru, bụ otu n'ime ndị sineeti Naịjirịa n'ụbọchị Maachị 7, 2018. Ego ole ndị sinetọ na-eri n'ụgwọọnwa adịghị n'ebe ọha na-ahụ ya anya ugbua. N'ụbọchị Maachị 20 2018 e jiri http://xe.com gbanwee ego n'ọnụ 1USD=359.200NGN, , 1GBP = 503.483NGN Ihe mgbakọ were ya na otu akpa osikapa ga-abụ ₦15,000 Kekọrịta peeji a Kekọrịta peeji a Akụkọ ga-amasị gị:" 44839629,https://www.bbc.com/igbo/44839629,"Anyị ekwenyeghị na mpụtara ntuliaka Ekiti, mmerụaka juru ya - PDP",Ntuliaka Ekiti:,"Otu PDP etinyela ọnụ na ntuliaka e mere n'Ekiti. Ha kwuru sị na agaghị akwọrinwu ha, ma kwuo na ha ekwenyeghị na rịzọọtụ ndị INEC wepụtara na ntuliaka a maka na ọ bụghị nke ọma ya dịka ha sị na ọ bụ APC, ndị ọrụ nchekwa na ndị INEC gbakọrọ aka ọnụ wepụta ya. N'akwụkwọ ozi Kola Ologbondiyan bụ odeakwụkwọ ọha nke Bekee kpọrọ 'National Publicity Secretary' nke PDP niile depụtara, o kwuru na PDP jụrụ rịzọọtụ a maka na mmerụaka dị ya. O kwukwara na ịkpọ Kayode Fayemi onye meriri ntuliaka a bụ ""izu mmadụ ohi n'anya ọcha, nakwa ime ihe na-abụghị uche ndị mmadụ nakwa iwakpo ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke anyị. Ologbondiyan kwuru na rịzọọtụ ndị si n'ebe e mere ntuliaka na gburgburu steeti ahụ gosiri na ""onye PDP bụ Kolapo Olusola-Eleka meriri etu tụrụ n'anya karịa Fayemi, mana Inec gbanwere ya ebe a na-agbakọ rịzọọtụ."" EFCC na Fayose N'aka ọzọ, ọ dị ka Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mmerụaka ego na Naịjirịa akpọrọ EFCC a na-eche onye na-achị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose aka mgba. Maka mmeri Kayode Fayemi bụ onye ga-anọchi Fayose meriri na ntuliaka, EFCC dere na Twitter sị ""Mmemme ebiela, akwa mgbochi ekewaala. Akwụkwọ ikpe mmerụaka gbasara ụlọọrụ ebe a na-azụ anụmanụ n'Ekiti ebe e mefuru naịra nde 1.3 ga-emepe. Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya."" Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya Akụkọ si mba ọzọ Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharị iwe akụkọtala mpi maka otu nwoke onye uweojii gbagburu maka na o che na o bu egbe. Ndị uweojii atọ merụrụ ahụ, ebe a nwụchiri ndị ngagharị iwe anọ. N'egwuregwu Frans ebuliela Iko Mbaụwa nke 2018 ka ha ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Kroeshia taa. Mmeri Frans mere ya ugboro abụọ ha ga-ebuli Iko a. Cheta na ha buliri ya bụ iko n'afọ 1998. Ọ bụrụ na Kroeshia meriri, ọ gaara abụ mbụ ha na-erute agba a ma bulie ya bụ Iko Gụọ etu Frans si merie n'uju ebe: World Cup 2018: France ebuliela Iko Mbaụwa 2018 Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Raymond Aliga bụ nwaafọ Igbo kwenyere n'akụ-ruo-ụlọ. Ọ sị na ọ bụ ya mere o ji wulite nnukwu ụlọ ebe a na-arụpụta ihe n'ala Igbo. 'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'" 45197624,https://www.bbc.com/igbo/45197624,Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo,E be o bidoro,"Igwe Onye a kpọrọ Igwe bụ eze na-achị obodo. Onye a ga-abụ onye chiri echichi dịka onye ọzọ maọbụ nze. Ọ bụ ndị ọcha bụ ndị bidoro itunye ndị mmadụ ugo dịka Igwe na-ala Igbo. N'oge gboo, ọ bụ nzụkọ ụmụnwoke a kporọ 'Ndị Ichie' bụ ndị na-achị obodo dị iche iche n'ala Igbo. Ebe ọ kachasị Ndị obodo dị iche iche n'Imo, Anambara, Abia na Enugwu steeti kachasị echi ndị mmadụ Igwe. Onye na-echi Igwe Onye ga-abụ Igwe n'ala Igbo ọbụla ga-abụ Amadi. Ọ ga-abụkwa onye chiri echichi dịka onye ọzọ maọbụ nze n'obodo ya. Obi Obi dịka Igwe bụ aha onye na-achị obodo ahụ n'ala Igbo. Mana ọ bụghị ọtụtụ obodo n'ala Igbo na-echi ndị mmadụ dịka obi. Ebe aha a pụtara O nweghi onye ga-enwe ike ikwusi ike ebe aha a pụtara, O nwere akụkọ mgbe gboo na-akọwa na aha Obi sị ala Bini n'ime Edo steeti bata n'ala Igbo. Ebe ọ kachasị N'ala Igbo ugbua, ọ bụ obodo dị iche iche n'ime Delta steeti na-enwekarị ndị Obi dịka ndị na-achị ha, mana obodo dịka Onitsha n'ime Anambara steeti nwekwara Obi nke ha. Onye ka a na-echi Obi Ọtụtụ obodo na-echi Obi na-agba mbọ hụ na ọ bụ onye sị agbụrụ ezinaụlọ Obi puta. Mana o nwere ndị obodo ọzọ na-echi onye ọbụla bụ nwaamadi obodo ahụ. Eze Aha Eze pụtara n'aha ugo nke a kpọrọ nze maọbụ ọzọ n'ala Igbo. A na-akpọkwa ya Ezedike, ihe aha a pụtara bụ na mmụọ ndị ichie obodo ahụ biri n'ime onye ahu bụ Eze. Ebe ọ kachasị Ochichi Eze bụ nke a kacha ahụ n'ala Igbo karị ochichi ndi ọzọ anyị kpọrọ aha n'ime akụkọ a. N'ala Igbo, n'oge gboo ruo ugbua, obodo dịka Arochukwu n'ime Awka, Anambra steeti, Nri-Igbo n'ime Owere, Nsukka. Enugu-Ezike na Ovoko na Iheakpu n'ime Awka bụ ala dị iche iche ama ama ka na-echi Eze. Dịọkpa Ọ bụ sọọsọ ụfọdụ obodo n'ala Igbo ka na-enwe ndị Diokpa dịka ndị na-achị ha ruo ugbua. N'ime obodo dị iche iche na Delta steeti onya tokasịrị n'obodo ahụ bụ onye na-achị obodo ahu. Ebe aha a pụtara Ọ bụ ndị anịọma na Delta steeti kachasị echi ochichi a. Akụkọ ihe mere mgbe gboo kọwara na aha a pụtara na Akwukwu n'ime Delta Steeti, Odaigbo n'ime Ọgwashi-Uku na Delta steeti nakwa Ibuzor n'ime Delta steeti. Onye ka ha na-akpọ Diọkpa Ha anaghị echi 'Diọkpa'echi. Ọ bụ nwoke bụ nwa nke mbụ bụ Diọkpa ezinaụlọ ọbụla n'ala Igbo. Onye na-achị ogbe ọbula dịka Diọkpa bụ onye kachasị n'oche n'ogbe ahụ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-49276150,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49276150,Aba Killing: Ihe ndị uweojii na-ekwu maka nwaamadị egburu n'Aba,Akụkọ dị mkpa :,"Agbagbuola otu nwaokorobia n'Aba Ọnụ na-ekwuchitere ndị Uweojii nke Abia Steeti bụ Geoffery Ogbonna gwara BBC na n'ezie na a gbagbụrụ otu nwaokorobia n' Umuokereke, Obingwa, Aba. O kwukwara na ndị uweojii gbalịrị ikwusị ndị okorobia bụ ozu onye agbagbụrụ ime ngagharịiwe tupu ọ banye ọgbaaghara. Ogbonna gwakwara BBC na Eze Ododo ahụ edele akwụkwọ degara ndị uweojii maka ihe mere. Ọ na- akowa na ndị uweojii na-agba mbọ ịchọputa onye gbagburu nwoke ahu. N'aka nke ọzọ, akụkọ na-agagharị na soshal midịa na-ebo ebubo sị na ọ bụ onyegha gbagbụrụ nwoke ahụ maka ịjụ inye ngagharị. Ndị agha egbuola ndị uweojii atọ Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Frank Mba sị na ndị uweojii atọ lara mmụọ mgbe ndị agha Naịjirịa ji egbe wakpoo ha ma tọghapụ onye ntọ ha kpụ aga n'okporoụzọ Ibi-Jalingo dị na Taraba Steeti. Mba kwuru na ndịagha a gbagburu ndị uweojii ahụ na-agbanyeghị na ha huputara na ha bụ ndị uweojii. O kwukwara sị ""Ndiagha a tụghapụrụ onye ejieji maka ntọrị bụ Alhaji Hamisu, onye nọ n'ọsọ ugbua"" Col Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ndịagha kwuru na ndịagha ahụ gbagburu ndị uweojii ahụ amaghị ama dịka ha nwetere ozi na ndị ntọ kpụ ndị mmadụ na-agafe. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ka na eme nyocha maka ihe a mere. Lee akwụkwọ ndị uweojii deputara si na ndịagha gburu ndị uweojii atọ ma tụghapụ onye ntọ ama ama ha jidere. Maurice Iwu amala n'ọnya ndị EFCC Ụlọikpe ukwu dị na Legọs enyela ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), ikike ijichi onye bụbụ onyeisi Inec bụ Maurice Iwu rue ụbọchị Fraide oge a ga-ekpe ikpe ma a ga-atọhapụ ya. EFCC kpụpụrụ Iwu ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka ego ruru otu ijere naira na ụma(N1.2billion.) Iwu rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec bido n'afọ 2003 rue afọ 2010 n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo. E boro Iwu ọtụtụ ebubo akwụbaghị aka ọtọ n'ihazi ntuliaka 2007 e mere oge ọ nọ n'ọkwa. Gọọmentị Kaduna ekwuola ihe ha chọrọ tupu ha ahapụ el-Zakzaky Sheikh Ibrahim Zakzaky Gọọmentị Kaduna ewepụtala usoro ha sị ha ga-eji kwenye n'ikike ụlọikpe nyere ka Ibrahim el-Zakzaky na nwunye ya gaa nata ọgwụgwọ n'India. N'akụkọ gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir el-Rufai tinyere na soshal midia, steeti ahụ si ka a kawa ahụ hụ na EL-Zakzaky ejighi ohere a gbaa ọsọ ndụ na mba ọzọ. Senatọ Ukazi na ICPC Ngalaba na-ahụ maka mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) amanyela Omeiwu Chukwuka Utazi ike ngwaọrụ o kwesịrị ike ndị Enugwu Nọt dika ihe Bekee kpọrọ ""Constintuency Project"". Ngwaọrụ ndị a dị n'ụlọ Ukazi gafee otu afọ gunyere ọgbatumtum 228, keke napep 51, igwe e ji akwọ ihe 203 na transformer ise. N'Egwuregwu Ed Woodward Nke na-ewu na soshal midia ugbua bụ #WoodwardOut. Ed Woodward bụ osote onyeisi oche otu Manchester United nke ndị nkwado otu bọọlụ ahụ chọrọ ka a chụọ ya n'ọrụ. Iwe ha bụ na kamgbe Woodward malitere ọrụ dịka osote onyeiusioche, Man Utd ebutebeghi iko ọbụla. Obi adịghịkwa ndị nkwado Man Utd mma maka na onweghi onye ndị otu ha gotere ga-anọchị anya Romelu Lukaku bụ onye nke hapụrụ ha gawa Inter Milan. Lee ihe ụfọdụ na-ekwu: Man City azụrụla Cancelo Joao Cancelo abatala Manchester City Ndị otu egwu bọọlụ Manchester City ejirila ego gbara ọkpụrụkpụ n'ụda nde paụnd 60 were zụpụta Joao Cancelo n'aka ndị Juventus. Dịka Cancelo na-abata Manchester City, ka Danilo Luiz da Silva na-agba n'azụ si Manchester City agafe Juventus n'ọnụ nde paụnd 34. Lee Akụkọ Ga-Amasị gị Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ" afirika-45617680,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45617680,Akụkọ dị mkpa taa: Enyimba agbawaala Rayon Sports anya,Akụkọ dị mkpa taa,"Mmeri Enyimba n'asọmpi CAF Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 Otu egwuregwu bọọlụ Enyimba ji ọkpụ goolu ise chara acha asatara otu (5-1) merie ndị Rayon Sports nke Rwanda n'asọmpi iko CAF confederation agbara taa. Ndị nyere goolu gụnyere Stanley Dimgba, Ikouwem Udo, Sunday Adetunji, Joseph Osadiaye na Isiaka Oladuntoye. A ga-emegharị ntuliaka Osun steeti Ntuliaka na-aga n'ihu n'Osun state Ụlọọrụ INEC ekwuputala na ntuliaka iji họpụta gọvanọ Osun Steeti e mere ụnyaahụ ezughi ezu n'ihi ọnụ ọgụgụ vootu ndị akagburu n'ụfọdụ ebe. Joseph Adeola Fuwape bụ onye gụpụtara vootu a kwuru na aga-emegharị ntuliaka ahụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Seputemba. Ndị ntọọrị akpara ike ọzọ Ndị ohi oke osimiri bụ Pirates na bekee wakporo ụgbọmmiri ngwaahịa nke Swiss n'oke osimiri si Legọs gawa Portharcourt ụnyaahụ. Ndị ohi a tọọrọ mmadụ iri na abụọ bụ ndị so ụgbọmmiri ahụ eme njem. Ụgbọmmiri Ngalaba na-ahụ maka mmekọ mba Switzerland na mba ndị ọzọ kwụrụ na ọ bụ ụlọọrụ obodo ha nwe ụgbọmmirị ahụ, ma sịkwa na ọnweghị onye be ha so na ndị aka ji. Ụgbọmmiri a bu ihe oriri Bekee kpọrọ wheat site Pọt Hacọt na-aga Legọs. Na mba ofesi, Onyeisiala mba Iran bụ Hassan Rouhani akatọọla mba Amerịka maka mwakpo emere ndị agha n'obodo Avhaz. Rouhani kwuru na ọ bụ Gulf steeti mba Amerịka na-akwado butere mwakpo a mana Amerịka agọrọla ụkwụ na aka ha. N'egwuregwu, Anthony Joshua meriri Alexander Povetkin na ọkpọ ha pịara unyaahụ na ama egwuregwu Wembly nke dị na Briten. Povetkin bịara asọmpị ahu ka ọ mara ka ọ ga-anapụ Joshua ọkwa ya dika onye tụụrụ ugo na ịpịa ọkpọ n'ụwa niile nke Bekee kpọrọ world heavyweaight title, mana Joshua pịatụrụ ya na agba nke asaa. N'asọmpi Premier league, Chelsea enweghi ike merie ndị West Ham dịka onweghi ndị nyere onwe ha goolu. Gee nkeji nke taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha." afirika-44798289,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44798289,Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ewepụla ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu na Platu steeti na onye ndu ndị ụlọomeiwu,Akụkọ ndị dị mkpa,"Okwu na-ewu n'elu soshal midia ọkachasị Twita bụ ihe gbasara ikikere nwaanyị ịzụta maọbụ rite ala n'aka nna ya n'ala Igbo. Ụfọdụ na-ekwu na ha kwenyere n'omenala a ebe ndị ọzọ na-ekwu n'oge eruola iji gbanwe ya bụ omenala. Ndị ụlọomeiwu Imo steeti nwere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ekpebiela na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma aga-achupụ ya n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ maọbụghị. Cheta na ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti kwuru na ha ga-achutu Madumere maka ebubo nrụrụaka ha boro ya. N'okwu yiri ibe ya Achụturu Peter Azi bụbu ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nke Platu steeti n'ọkwa ya n'ehihie taa. Onye ọọ ewepụrụ bụ inyeisi ndị kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Henry Yunkwap. N'akụkọ ofesi Praim minista mba Jamini na Onyeisiala mba Amerịka amaala aka dịka ha na-akwado ịga nzụkọ otu NATO na Brussels. Donald Trump na-ebo ụfọdụ mba n'ime ọgbakọ ahụ ebubo ịkpachi ego ha. N'Egwuregwu, Ebe niile tọgbọ chakoo ugbua na mba Briten ebe otu egwurewgwu ha na-akwado ị zute Kroeshia na asọmpị ga-egosi onye ga-abịa nso ị bu ikombaụwa. Anyị ga-ama onye ga-emerị ma ọ kụọ elekere asaa nke mgbede a. Gee nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45894716,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45894716,Rice import ban: Mmachi rice ofesi mere ego bata n'ịkọ osikapa Abakaliki - Ọkọugbo,Jerry Oduma bụ ọgaranya.,"Ọ kpatara ego ya n'ịkọ ugbo, nke osikapa bụ eze n'ime ihe ọ na akọpụta. Oduma gwara BBC Igbo na ya enweghi ike ịrụ ọrụ ọzọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ ugbo. Ọ sịkwa na ọ bụ ego ọ na-eweta n'ọrụ ugbo ka o ji azụ ụmu ya na mahadum. Kirie etu o si arụpụta osikapa ya n'elu. Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-46779419,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46779419,Nigeria Election 2019: Oby Ezekwesili ga-etinye anya na nwulite akụnaụba obodo,Akụkọ dị mkpa,"Oby Ezekwesili ekwuola na ihe kachasị mkpa ọ ga-eme bụ iwepu ntụkwasị Naịjirịa nwere na mmanụ agbịdị dịka ahịa na-ewebata ego. O kwuru na ọ bụ akụnaụba obodo na-agbatu bụ ihe na-ebute nsogbu niile e nwere na obodo Naịjirịa Oby Ezekwesili: 'M ga-agba mgba dị na ndọrọndọrọ 2019' ""Aga m eme ka Naịjrịa nakwa mba ndị ọzọ jịkọọ aka luso ndị na-eyi ndụ egwu agha"" ka o kwukwara dịka o kpughere ya bụ usoro n'Abuja taa. N'agbanyeghi na Oby Ezekwesili bụ aha ama ama, naanị ụfọdụ mmadụ ole na ole bụ ndị pụtara ịkwado ya. Ọzọ, Otu ụlọikpe kachasị na Rịvas steeti akagbuola ntuliaka imeụlọ abụo otu ndọrọndọrọ APC mere na steeti ahụ nke pụtara na onweghi onye ga-anọchị anya APC n'ịzọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka na-abịa. Mmadụ abụọ ihe a metụtara bụ Magnus Abe na Tonye Cole, bụ ndị malitere ịchụ nta vootu tupu ụlọikpe e mee mkpebi a. N'otu aka ahụ, ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec, edepụtala ozi kwuru na ndị denyere aha maka ntuliaka 2019 karịrị mmadụ nde iri asatọ na anọ. N'okwu ego Ngalaba na-ahụ maka nchịkọta ụtụ isi na Naịjirịa bụ FIRS ekwuola na ego ha ritere n'afọ 2018 niile gafere naịra tarị ise n'ọma. Na mba ofesi, Gọọmentị mba Gabon ekwuola na ha anwuchiela ndị agha ise bụ ndị chọburu ị nara ọchịchị n'ike. N'uche ndị agha ahụ ha chọrọ ịme ka obodo Gabon nwee ọchịchị onye kwuo uche ya N'egwuregwu, Otu bọọlụ Delta Force arịọla ndị nso ha mgbaghara dịka otu Bendel Insurance ji ọkpụ goolụ atọ merie ha n'asọmpị Nigeria National League. Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị agha apụọla n'ụlọọrụ ntaakuko Daily Trust dịka gọọmenti etiti gwara ha Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na esemokwu ọbụla dị n'etiti ndị agha na Daily Trust bụ ihe ekwesiri iji mkparịtaụka mezie. Amabeghi ma ahapụla ndị ntaakukọ Daily Trust abụo ndị agha nwuchịrị. Ngalaba ""Lafia Dole"" enwetala ndị ọchịagha ọhụrụ N'akụkọ ọzọ metụtara nke a, ndị agha Naịjirịa ahọpụtara ndị ọchịagha ọhụrụ ha si ga-enye aka ịhụ na-emeriri BOKO Haram. Akụkọ a si n'ọnụ ọchịagha Sani Usman bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa . Ọchịagha Usman sị na ndị ga-arụ ọrụ na ngalaba Lafiya Dole. N'ofesi, Ndị aka ha dị n'ihe nkiri na Hollywood mere emume ntụrụ ugo a kpọrọ ""Golden Globe Awards n'abali. N'emume ahụ, ihe nkiri 'Bohemian Rhapsody' tụrụ ugo dịka ihe nkiri kachasị mma, ebe Onye nkiri Rami Malek so n'ihe nkiri ahụ tụrụ ugo dịka ọkacha eme ihe n'ihe nkiri n'afọ 2018. Golden Globes bụ ohere ndị nkiri ji akụrụ ndi mere ọfụma n'ihe nkiri n'afọ gara aga aka. N'egwuregwu, Wayne Rooney gbaara Manchester United bọọlụ afọ iri na atọ site n'afọ 2004 ruo 2017 tupu ọ gaa Everton bụ ebe o bidoro ịgba bọọlụ Ọnụ na-ekwuchitere ọgba bọọlụ bụ Wayne Rooney ekwuola na ihe mere eji nwụchie ya n'ihi ịṅụbiga mmanya oke bụ maka enweteghi onwe ya oge ọṅụchara ọgwụ ụra. A nwụchiri Rooney na Disemba 2018 n'ọdọ ụgbọelu Dulles dị na Virginia ebe e mechara rie ya iwu ọnụ ego dị dọla iri abụọ na ise. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-45041658,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45041658,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: 'Super Falconets' agaala iko mbaụwa ụmụnwaanyị taa,Akụkọ dị mkpa,"Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole agwaala onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki ya si n'ọkwa ya ritue. Oshiomhole gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ugwu kwesiri ekwesi dịka ya, onyeisiala Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị sinetọ APC gbachara izu ụnyaahụ na. Ihe ọzọ pụtara na nzụkọ ahụ bụ na aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha kwuru na ọ nweghi onye ọzọ ga-ahapụ pati ha. O kwuru na ha bubu n'uche na ndị ahụ gafere n'otu PDP na ndị ọzọ ga-apụ. Na mba ofesi, BBC captures footage of post-election violence in Harare Otu chikọtara mba uwa niile bụ UN nakwa mba Briten arịọla ka ndị agha jiri nwaanyọ sobe ndị na-eme ngagharị iwe ntuliaka na mba Zimbabwe. Cheta na ọgbaaghara dara na ntuliaka emere na Zimbabwe ụnya ahụ tara isi mmadụ atọ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyị Naịjirịa bu Falconets ga-aga mba France taa nke a bụ maka njem ị bụlata iko mba ụwa ụmụnwaanyị na-ebido na France n'ụbọchị ise nke ọnwa ọgọst. Lee nkeji nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-46756536,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46756536,"""Onye ọbụla zuru ọbante nwaanyị chọrọ ịgbu ya"" - Ndị uweojii",Akụkọ dị mkpa,"""Ọnye ọbụla zuru peteri maọbụ ọbante nwaanyị chọrọ igbu ya"" Ọ bụ ihe a ka ọnụ na-ekwuchitere ndịuweojii na Legọs steeti Dolapo Badmus kwuru gbasara akụkọ a na-anụ na ndịmmadụ na-ezu ọbante ụmụ nwaanyị ma jiri kwa ya gwọọ ọgwụ ego. O kwuru na ebe ndị a na-ezu ọbante ha na-anwụ, na ndị na-ezu ha abụghị ndị ohi kama ndị na-achọ ịgbu mmadụ. N'ọwụwa anyanwụ Rụọ nụ ọrụ 'egwu eke' ọfụma Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi agwaala ndịagha ha siri ụzọ ziri ezi we rụọ ọrụ egwu eke nke ha malitere n'ọnwa jernụwarị. O kwurukwara na ndịagha chọọ ụzọ ha ga-eji metuo obi ndị ọwụwa anywanwụ iji mee ka olileanya atụkwasiri ha gbalite. N'ofesi Ndị uweojii ebidola nyocha n'etu nwaanyị amaghị onwe ya ihe ruru afọ iri nọ n'ụlọọgwụ siri tụrụime mụọ nwa na nwgụcha ọnwa dizemba afọ 2018. Ụlọntaakụkọ CBS kwuru na nwa ọhụrụ ahụ gbasiri ike nakwa ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ amaghị na nwaanyị mmadụ dị ime. N'egwuregwu Onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick agọọla akụkọ kwuru na onyeisiala Muhammadu Buahari enyela iwụ ka eme ya nyocha maka mpụ ego. Ọ gọkwara na amachịrị ya ịme njem maka ya bụ nyocha. Gee Nkeji ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Inec ekweghị ịwepụ Amina Zakari Ndị ọrụ Inec gosikwara njikere ha dị ibido ihe ha bịara Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec asala PDP na pati iri itoolu ọzọ chọrọ ka ewepụ Amina Zakari dịka onye nhazị ebe a ga-anọ gbakọ ọnụọgụgụ vootu atụrụ na mbinye aka nke eji ahụpụta onyeisiala. Inec kwuru na onye ikike mkpokọta vootu dị n'aka bụ onyeisioche Inec bụ Mahmud Yakubu, nke mere na-enweghi ike inye onye ọzọ ohere ime ya bụ mgbakọ ikpeazụ. Inec sị na ọrụ Zakari emetutaghị ịgụ vootu, kama na ọ bu ihazi ebe a ga-anọ mee ya bụ mgbakọ. Gọọmentị na NLC ekwetebeghị maka ọgwọ ọnwa opekatampe Nzụkọ ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress na gọọmenti etiti nwere achitaghi aja enwereike kpọọ aha. Chris Ngige, bụ minista na-ahụ maka ọrụ gwara ndị ntaakụkọ na NLC na gọọmenti ga-ezute ọzọ n'ụbọchị Monde na-abịa. O kwukwara na mkaritaụka ha maka ọgwọ ọnwa opekatampe na-aga n'ihu nke ọma. N'ofesi, Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala Amerika bụ Donlad Trump na ndị omeiwu Demokrat ka na-ama akwa aka banyere mgbidi ọchọrọ iru n'oke ha na mba Mexico. Trump kwuru na ya dị njikere ka mgbachi ụfọdu ụlọọrụ gọọmenti bụ ihe ndọrọnndọrọ a butere bụrụ ihe ga-aga n'ihu. Ọsịkwa na ya nwereike tinye ihe Bekee kpọrọ national Emergency maka nke a. Maradona apụtara n'ụlọ ọgwụ Onye ama ama n'egwuregwu bọọlụ bụ Diego Maradona apụtara n'ulọọgwụ ebe ọnatara ọgwụgwọ maka ọbara na-agba ya n'afọ. Ada Maradona aha ya bụ Dalma sị na nna ya dị mma. Ụjọ bara ndị na-akwado Maradona ahụ mgbe akuko pụtara na enyere ya akwa n'ụlọọgwụ mgbe achọpụtara na ọbara na-agba n'ime afọ ya. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-46531224,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46531224,Nigerian Senate: Ụlọomeiwu ajụla ịkwado ha ndị EFCC si n'aka Buhari,Akụkọ dị mkpa,"Ụlọomeiwu ajụla aha onyeisiala zigaara ha Ndị ụlọomeiwu ukwu ajụla ibinye aka n'aha mmadụ anọ bụ ndị onyeisiala Buhari họpụtara dịka ndị ndu ụlọọrụ EFCC. Kọmiti ndị omeiwu na-ahụ maka nrụrụaka kwuru na o nweghị onye si na mpaghara ọwụwanyanwụ aha so na ndị ahụ. Uweojii nwụchiri ndi okpukpere Juu Ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị okpukpere Jew dịka ha na-eme ngagharịiwe n' Umuahia, isi obodo, Abia steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Abia Steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo ndị otu Ipob kwunyere ndi okpukpere Juu na ngagharịiwe ahụ. N'ofesi Ndị ndu mba Rọshịa na Amerịka na-agbarịta onwe ha egbe ọnụ n'ihi ụgbọelu ọgụ abụọ bu ngwaagha nuklịa nke mba Rọshịa fedatara na mba Venezuela. Nke a na-egosi nkwado mba Rọshịa na-enye gọọmentị mba Venezuela nke onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro. N'egwuregwu Pep Guardiola bụ onye bubu onye nchịkọta otu Bayern Munich Onye nchịkọta otu egwu Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na ịkpa oke dị n'ebe niile na ọ bụghị naanị na egwuregwu bọọlụ. Ndị uweojii ka na-enyocha ikpa oke a kpasoro onye otu ya bụ Rahim Sterling. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Nigeria Elections 2019: Buhari nwereike ida ntuliaka 2019" afirika-46930650,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46930650,2019 Election: Ndị ndọrọndọrọ anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara na ntụliaka - Lai Mohammed,Akụkọ dị mkpa,"Onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Lai Mohammed, e kpugheela ihe ọkawara dịka nkata ọjọọ ndị ndọrọndọrọ na-anọghị n'ọchịchị na-akpa iji kụnyere ntụliaka nke ọnwa Febụwarị 2019 ụkwụ. N'ozi o zipụrụ ụbọchị Monde, Mohammed kwuru na ọchịchị etiti enwetala ozi na ndị a na-anọghị n'ọchịchị chọrọ ibute ọgbaghara iji kposaa ntụliaka ahụ na-abịa abịa, ma nye ohere ka enwee ọchịchị nchere oge. O kwuru na ha enwetakwala ozi na ndị a akpọtụrụla otu Boko Haram, ndị ojiegbe ezu nakwa ndị agha egoro ego si mba Niger, iji buo agha megide ndị nọ na ọchịchị, nakwa steeti dị iche iche gụnyere Adamawa, Bauchi, Borno, Benue, Kano, Kaduna, Nassarawa, Plateau, Taraba nakwa steeti Zamfara. Onye Minista a nyere mmasịobi ike na ọchịchị etiti na-agbasi mbọ ike iji kụgharịa ajọ ọnọdụ a, ma mee ka enwee ntụliaka nke afọ 2019 bụ ịgba. Ọ rịọziri ndị Naijiria ka ha mụrụ anya ka azụ na ụbọchị ndị na-abịa abịa, ma gbakwụnye na ụlọọrụ ndị nọ n'okpuru ụlọọrụ ya ga-arụ ọrụ iji hụ na-agwara ndị Naijiria ka o si akpọtụ gbasara ntụliaka na-abịa. OBJ sị na APC na-anabta ndị ohi Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Ọ bụ onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasajo na mkparịta ụka ya na BBC nwere sị onye ọbụla nwere ike izugbu Naijirịa n'ohi ma ọ nweghị ihe a ga-eme ya ma ị nọrọ na pati APC. Chebiri akụkọ a n'uju na elekere isii ụtụtụ echi. Lai Mohammed na-ahụ ọgbaagha na 2019 Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Ọnụ na-ekwuru gọọmenti etiti bụ Laị Mohammed oboro ndị pati na anọghị n'ọchịchị ebubo mgbaokpuru maka ịbute ọgbaaghara na ntuilaka 2019. WhatsApp ebeletala ikesa akụkọ WhatsApp N'ofesi, Ọba nzikọrịta ozi Whatsapp ekpebiela ịbelata mmadụ ole ị nwere ike ịgbasara ozi otu mgbe dịka onyeisi ha siri kwuo na Jakarta, Indonesia. Ụlọọrụ a mere nke a iji belata akụkọ ụgha eji ya bụ ọba nzizọrịta ozi agbasa bụ nke eboro na ọ tara isi mmadụ ole ma ole mgbe gara aga. Mmadụ atọ n'otu ezinaụlọ agaala mkpọrọ otu mgbe Efe Sodje, onye egwu bọlụ larala ezumike nka N'egwuruegwu, akuko na-eru anyi ntị sị na atụrụ ụmụnwaanne atọ si ezinaụlọ Sodje eji egwuruegwu mara mkpọrọ maka ịkpabiri ego n'akpa ego ụlọọrụ ha guzobere iji enyere ndị ụwa na-ara ahụ aka. Atụrụ ụmụ Naịjirịa a bụ Efe, Stephen na Bright Sodje mkpọrọ kemgbe afọ 2017, mana ọ bụ ugbua ka iwu kwere ka agbasaa ozi ya. Gee Nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile F-SARS apụọla Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na onyeisi ndị uweojii ọhụrụ bụ Adamu Abubakar enyela iwu ka e kpochapụ ngalaba ndị uweojii a na-akpọ F-SARS n'ịchafụ. Onye na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ọnụ n'ihe gbasara soshal midia bụ Bashir Ahmad depụara nke a n'akara Twitter ya. Mana, BBC Hausa na-akọwa na mkpochapụ metụtara sọsọ ebe ọrụ F-SARS dịka ngalaba dị n'aka gọọmentị Naịjirịa. Ihe atumatu a pụtara bu na F-SARS alagachiela ịbụ SARS, ma ị nọkwa n'okpuru aka na-achi ndi uweojii na steeti dị iche iche. Buhari asaala Obasanjo Buhari na Obasanjo bụ generalụ Naijiria chiarala Naijiria dịka ndị agha nakwa dịka ndị akwa agbada Gọọmentị Muhammadu Buhari asaala onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo. N'ọsịsa ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu binyere aka, gọọmentị etiti sị na Obasanjo na-eme anya ụfụfụ makana Buahri ka nwe ugwu. Ha gara n'ihu kwuo na eziokwu adịghị n'ebubo niile Obasanjo boro Buhari na APC banyere ntuliaka n'abịa. ASUU ekwuola ebimnobi ha banyere abụbụ ọrụ ha Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị nkụzị mahadum bụ ASUU enyela gọọmentị etiti atụmatụ ha ga-eji laghachi ọrụ. Biodun Ogunyemi bụ onyeisi ASUU sị na ha ga-akagbu abụbụ ọrụ bidoro kamgbe afọ 2018 ma ọ bụrụ na gọọmentị kwụọ ha ijeri naira narị abụọ na iri abụọ (220 billion). Aka uweojii ji ndị na-ere nri nwa Ndị uweojii na mba Australia awụchiela mmadụ ise ha sị aka ha dị na nrụrụaka metutara ire nri nwa na China. Nrị nwa kwa? Eziokwu, China bụ mba ebe ntụbata nrị nwa bụ ahịa ukwu na-enye ego. Nke a bụ maka ujo nri nwa adigboroja. Rangers agaala ihu n'iko CAF Otu Rangers International nke Enugwu jị ọkpụ goolu abụọ asatara otu sị Bantu FC nke mba Lesotho gaa nke ọma n'asọmpị CAF Confedration cup Mmeri a nyere Rangers ohere ịga n'ihụ na-agba ọzo n'asọmpi a. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Jude Nnam: Ọtụtụ ndị ụkọchukwu busoro egwu m agha" afirika-46218837,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46218837,Anambra Impeachment: Akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike,Akụkọ dị mkpa taa,"End of Twitter post, 1 Ọka na-ekpo ọkụ ugbua. Akụkọ si Ọka kwuru na ọgbaghara dara n'ụlọomeiwu Anambra steeti nke mere ndị uweojii jiri gbochie ụzọ esi aba n'ime ya. Anya hụrụ ihe mere sị anwụrụ anya mmiri chusara ndị mmadu na gburuguru Obi Gọọmenti n'Ọka. N'akụkọ metụtara nke a, onyeisi otu APGA n'Anambara steeti bụ Chief Norbert Obi akwụsịla mmadụ atọ ọrụ n'ike maka nkata akpara iji chụtuo onyeisi ụlọomeiwu Anambara. Ndị a kpọrọ aha ha maka ihe a bụ Ikem Uzoezie, Harford Osekke nakwa Victor Okoye. Onyeotu pati APGA achọghị ka-akpọpụta aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na-akwụsịrị mmadụ atọ a ọrụ n'ike n'ezie. N'ofesi Onye ọkaiwu gọọmentị Saudi Arabia ekwuputala na ha na-atụ mmadụ iri na otu aka maka ọnwụ Jahmal Khasoggi. O kwuru na ọ bụ osote onyeisi uweojii nzụzọ nyere iwu ka kpulata Khasoggi Saudi Arabia, ma kwukwa na aka ọkparaeze Mohammed bin Salmman adịghị n'ọnwụ ahụ. N'egwuregwu Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ FIFA ezigarala ogbo ha nke Naịjirịa ozi itiakanobi maka ọnwụ Ajuma Otache. Otache bụbụ osote onye nkuzi otu ụmụnwaanyị Naịjirịa nke pụrụiche tupu ọ nwụọ. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Ihere adịghị na nwoke ị mee nwaanyị mbọ -Onyedika A mịpụla ego ọzọ n'akpa NLNG - Sineti Ụlọomeiwu ukwu bụ Sineti ekwuola na ha achọpụtala ego dị otu ijeri dọla ndị ụlọọrụ NNPC mịpụrụ site n'akpaego ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ gaasị bụ NLNG. Onyeisi kọmitee mere nyocha ahụ bụ Bassey Albert Akpan agwala ndị NNPC na CBN ka ha gosi akwụkwọ eji mịpụ ego ahụ. Ị chọrọ ụgwọ opekatampe ka ọ bụ ọrụ gị? - Ndị gọvanọ Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ha agaghị akwụlị puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe ọhụrụ ma ọ bụghị ya na ha ga-achụlata ụfọdụ ndị ọrụ n'ọrụ ha. Gọvanọ Abdulaziz Yari nke Zamfara bụ onyeisi ndị gọvanọ kwuru na ha ga-aga hụ onyeisiala Buhari ka a achọọ ụzọ ọzọ a ga-esi gboo nsogbu a. Na mba Amerịka: Osote onye ndụmọdụ na nchekwa na 'White House' bụ Mira Ricardel ahapụla ọrụ n'ihi nsogbu dị n'etiti ya na nwunye onyeisiala bụ Melania Trump. Cheta nwunye Trump gwara Ricardel na onwezighi ugwu ịrụ ọrụ na 'White House'. N'egwuregwu Ndị Super Falcons nke Naịjirịa awụchiela na Ghana maka asọmpi Iko mba Afrịka ụmụnwaanyị ga-amalite na Satọde abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba. Nke a bụ agba nke iri na otu asọmpi a, bụ nke ha mabuterela ugboro asatọ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri Apprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka" afirika-44545091,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44545091,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wilshere apụọla na Arsenal,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ọgbakọ ụmụ nwaanyị Abia steeti arịọla ndị uweojii na steeti ahụ enyemaka ịkwụsị mpụ na ihe ojọọ dị ịcheiche a na-emeso ụmụnwaanyị kachasị ụlọ na-agba mgbere nwa ọhụrụ. Nkechi Ikpeazụ nwunye gọvanọ na-achị Abia kwuru na ịgba akụwụna, mwakpo n'ike na ịmegbu ụmụnwaanyị ajadu so na ihe ndị ekwesiri ịleba anya ma kwụsị kwa. Ọzọ, Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Gọọmentị etiti eweputala atụmatụ isii ha kwuru na ọ bụ ị ji kwusi nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na Naịjrịa. Cheta na kemgbe mbido afọ 2018, okwu a eriela ndụ mmadụ narị ole na ole kachasị na Benue steeti. N'akụkọ ofesi, Mba Amerịka esila n'ọgbakọ oke na ugwu ruru mmadụ na UN a kpọrọ United Nations Human Rights council na bekee pụọ. Nikki Haley bụ onye nọchitere anya Amerịka na UN kwuru na nzụkọ ahụ dị aghụghọ ma na-akpa agwa ihu mma abụọ. N'egwuregwụ, Ka asọmpị iko mba ụwa jisike na-aga, Jack Wilshere bụ aha a ma ama n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ekwuola na ya ga-ahapụ otu ahụ na ngwụcha ọnwa Juun. O depụtara nke a n'elu Instagram ya na oge eruola ọ ga-eji chọrọ ụzọ ọzọ n'ọrụ aka ya bụ ịgba bọọlụ. Gee nkeji ụtụtụ ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47392138,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47392138,Presidential Election: Ihe anọ Buhari ga-emere m ka udo were chịa,Akụkọ dị mkpa:,"Ohaneze, NEF, Afenifere, MBF na NDF akwadola Atiku ịga ụlọikpe Otu ọdịnala na agbụrụ dị na Naịjirịa bụ Ohaneze ndị Igbo, Northern Elders Forum, Middle Belt Forum na Niger Delta Forum etinyela aka n'akwụkwọ ịgwado Atiku ịgawa ụlọikpe maka ịlebe anya na-atụm vootu emere ụbọchị satọde nke ha kwenyere na ozighịezi. Ndị tinyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ ndị isi otu ndị dịka Ọkamụta Ango Abdullahi, Chief John Nwodo, Chief Ayo Adebanjo, Chief Edwin Clark na Dkt. Pogu Bitrus. Buhari sị na ihe ga-atakwu akpọ Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC achụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosu nke Ogun steeti na pati ha. Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ. APC achụpụla Rochas? Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC akpawala nkata ịchụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosun nke Ogun steeti na pati ha. Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ. Ndị omekome wakporo ụmụnwaanyi ebe a tụrụ vootu Mpụ nwakpo na-eweta nnukwu mwute na Naijiria Inec ekwuola na-awakporo ụmụnwaanyị bụ ndị ọrụ ngo mgbe e mere ntụlịaka onyeisiala na Satọde gara aga. Agbanyeghị na Inec sị na udo chịrị na ọtụtụ ebe e mere ya bụ ntụlịaka mana ọgbaaghara dị n'ebe ụfọdụ nke ha akọwaghị nke ọma. Akpabio akwụsịla Inec inye Chris Ekpenyong asambodo Sen. Godswill Akpabio kwuru na ya anatala ụlọikpe ikike ịkwụsị Inec ịnye Chris Ekpenyong nke PDP asambodo meri maka ntụlịaka ha mere ụbọchị Satọde mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ. Akpabịọ sị na nke a ga-enye aka inyocha ihe mgbagwoju anya mere mgbe a tụrụ vootu ahụ. Edoola nwaanyị mbụ bụ ọkaikpe iyi ọrụ n'Anambra steeti Jọstịs Ijem Onwuamaegbu bụ nwaanyị mbụ bụ Okaikpe n'Anambara steeti Gọvanọ Willie Obiano edoola nwaanyị mbụ bụ okeiwu n'iyi ọrọ. Okiwu ndị steeti Alaigbo ndị ọzọ bịara emume a pụrụ iche n'Obi gọọmentị nke steeti ahụ. Super Falcons 4 - 3 Solvakia Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ Otu Super Falcons nke Naịjirịa ewerela ọkpụ anọ a satara atọ merie ogbo ha ndị Slovakịa na asọmpi Cyprus Women's Cup. Rita Chikwelu nyere goolu abụọ na ya bụ asọmpị . Gee nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile US na-achọ nwa Osama Bin Ladin Mba Amerịka ekwuola na ha ga-enye onye ọbụla ga-enye ha ozi bara uru gbasara nwa Osama Bin Laden bụ Hamza, otu nde dọla. Ha kwuru na Hamza a na-enyo na ọ nọchiri anya nna ya dịka onyeisi otu Al-Qa'ida, na-ekwu ekwu iwakpo mba Amerịka na ndị enyi ha. Udo Naịjirịa Abdusalami Abubakar chịburu Naịjiria dịka onye agha, bishọp ndị ụka katọlik na Sokoto bụ Matthew Kukah na ndị ọzọ nọ n'otu kpọrọ onwe ha National Peace Committee, zutere Atiku Abubakar na Peter Obi zọrọ ọchịchị na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nọ n'okpuru PDP, n'abalị Tọọzde. Na nzukọ ahụ, ndị otu ahụ na-ekpe udo gwara ndị PDP ka ha chefuo maka ịga ụlọikpe gbasara mpụtara ntuliaka a, mana PDP kwuru na ha ga-aga n'ihu makana ọ bụ ihe ọjọọ ma ha ghara ịgbagha ya maka ọdịniihu Naịjirịa. Ndị otu ""National Peace Committee"" a mechara gakwuru osote onyeisiala Yemi Osinbajo n'Aso Rock, ebe ha nọ nwee nzukọ gbasara ịhụ na udo dị site na ntuliaka a e mere Kingsley Moghalu ekwuola okwu Moghalu zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati YPP, kwuru na o wutere ya na ntuliaka a tara isi ndị mmadụ. O kwukwara na ọnụọgụgụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec gụpụtara na ọ bụ vootu ole a tụnyeere ya, abụghị ole o kwesịrị inweta, makana o zughi ezu. N'egwuregwu, Fulham achụọla Claudio Ranieri n'ọrụ dịka onye nchịkọta ha ma tinye Scott Parker ka ọ nọchie ya ruo mgbe ha họtara onye ọzọ. Ọchụchụ ya na-abịa naanị ụbọchị narị na isii e wechara ya n'ọrụ. Gere akụkọ BBC na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Ibeawuchi" afirika-46860955,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46860955,Nnamdi Kanu: Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ na-agbara Buhari mbọ,Akụkọ dị mkpa,"Onyeisi Ipob bụ Nnamdi kanu ekwuola na ndị gọvanọ mpaghara ọnwụwaanyanụ na-arụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ọrụ, ihụ na ọ lọghachitere n'ọchịchị ọzọ na 2019. Kanu kwuru nke a n'okwu o zipụtara n'igwe redio Biafra n'ụbochi ụka gara aga. Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti Ndị ga-eso na nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ Imo Steeti Ọ ga-akpọtụ n'Owerri n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri na asatọ nke Jenụwarị bụ mgbe oge nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Nrụrịtaụka a bụ nke ụlọọrụ mgbasa ozi BBC Igbo na-ahazi ga-enye ndị a ohere ịkọwara ndị Imo Steeti ọrụ ha ga-arụ ma ha baa n'ọchịchị. Nke a ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihie, a ga-agbasa ya n'igwe redio nakwa n'akara Facebook na Instagram bụ BBC News Igbo. N'ofesi Pawel Adamowicz bụ onye ọkaiwu tupu ọ ba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Pawel Adamowicz bụ Mayor mba obodo Gdansk nke mba Poland anwụọla n'ụlọọgwụ site na mma a mara ya ebe ọ na-arụ ọrụ ebere. Ndị uweojii nwụchiri otu nwoke ama ama n'ime mpụ gbara afọ iri abụọ na asaa maka ịkpa arụ a. N'egwuregwu N'asọmpị English Premier, Manchester City ga-anabata ndị Wolverhampton Wanderers iji mara ma ha a ga-agbago n'ogogo tebulu. A na-atụ anya na Sergio Aguero na Vincent Kompany bụ ndị si n'ute ọrịa gbakee ga-esonye n'asompi a. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri a were tụọ ndụ mmanụ Igbo Music: Gịnị mere ndị ọgbara ọhụrụ Igbo ji eleghara ụbọaka anya? Akụkọ ga-amasị gị Niger Delta agitators akatọla mkpọpụ Onnoghen Niger Delta Avengers chiri ochi ka gọọmentị Naịjịrịa tee nkwucha, maa chee aka ghọrọ ha mgbe adighị anya Onye ndu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo etinyele ọnụ na nkatọ mkpụkpụ gọọmentị etiti kpụpụrụ ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal. N'aka nke ọzọ, ndị ọgbakọ otu na azọtara ndị Niger Delta oke ha ekwuola na ha ga-ebido ịgbari ebe ana arụpụta mmanụ agbidi dị na mpaghara ahụ ma gọọmentị etiti kpa ya bụ nwaamdị aka. Trump adọọla Turkey aka na ntị Donald Trump boro ndị isiala mba Syria na Rọshịa ebubo maka ihe mere na Syria N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Turkey aka na ntị na ya ga-adọtụ akụnaụba ha ma ha kpaa agwa megide ndị Kurd ma ọ bụrụ mba Amerịka si na Sirịa pụọ. Ndị Kurd bụ ndị mba Turkey na-agụta dịka ndị agha nnupuisi kwadoro mba Amerịka n'oge ha na mba Sirịa lụrụ agha. N'egwuruegwu, Messi emeriela dịka onya ọkachasị agba bọọlụ na FIFA ugboro ise N'egwuruegwu ebe Manchester United ji otu ọkpụ merie Tottenham na Premier League, Barcelona ejirila ọkpụ atọ gwọ ndị Eibar ịba n'asọmpị La liga. Mmerie ndị Barcalona a nyere Lional Messi ohere inyezU goOlu narị anọ bụ nke mere ya onye mbụ mere otu a n'asọmpi La liga. Gee nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" 44489676,https://www.bbc.com/igbo/44489676,Akụkọ kachasị n'abali a: Shehu Sani chọrọ ka e nye ndị Ogoni 9 nturuugo,Akụkọ kachasị mere taa;,"Shehu Sani chọrọ ka ndị Ogoni 9 nweta nturuugo Sinetọ Shehu Sani ekwuola sị na gọọmentị etiti kwesịrị ịrịọ ezinaụlọ Ken Saro Wiwa na ndị ogoni ndị ọzọ ahụ nwụrụ anwụ mgbaghara ma nyekwa ha nturuugo. O kwuru sị ka e nyekwa Shehu Musa Yaradua, Beko Ransome-Kuti nakwa Chima Ubani nturugo. End of Twitter post, 1 Etigbuola nwoke gburu nwaanyị E tigbuola otu nwoke n'obodo Kisumu dị na mba Kenya ka a hụrụ ozu nwaanyị ọ fọnyere n'ime akpati. Kim Jong-Un a ga-aga Rọshịa? Vladimir Putin bụ onyeisi mba Rọshịa akpọọla Kim Jung-un nke Nọt Koria oku ka ọ bịa njem nleta na Rọshịa n'ọnwa nke asatọ nke afọ a. Putin sị na ya nabatara ogbakọ Kim na Trump mere n'ime ụbọchị ole na ole gara aga. N'egwuruegwu, Asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 ebirila ọkụ taa, dịka mba Rọshịa bu ụzọ nye goolu mbụ n'asọmpi ahụ. Ọ bụ Yuri Gazinskiy nke Rọshịa ji isi buba boolu a na nkeji iri na otu ebidochara ya bụ egwuruegwu. Rọshịa mechara gwọọ Sawudi Arebia ka ji mmanụ. Ha gbatara Roshịa 5 - Sawudi 0. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Rọshịa 2018: Super Eagles nọ n'otu kachasi ike" media-45238120,https://www.bbc.com/igbo/media-45238120,Nlaghachị Buhari ọ ga-edozi obodo?,Buhari alọtara Naịjirịa,"Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari lọtara Naịjirịa ụnyaahụ. Cheta na ọ gara njem ezumike n'ala UK n'ụbọchị atọ n'ime ọnwa Ọgọọst. N'azụ ya, onye nnochitere anya ya bụ Ọsote Onyeisiala Yemi Osinbajo mere ọtụtụ ihe mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-aja ya ọma. Mana echiche ndị mmadụ ugbua bụ ma Buhari ga-eme emegharị ụfụdụ mkpebi Osinbajo kpebiri oge ọ bụ onyeisiala? Ndị ọchịehi wakporo anyị - ndịagha Naịjirịa Onyeisi atụmatụ nchekwa ndịagha Naịjirịa akpọrọ ""Operation Whirl Stroke"" na Bekee bụ Gen. Adeyemi Yekini kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ndịagha n'obodo Guma n'ime Benue n'ụbọchị ole na ole garaaga mana onweghị onyeọbụla nwụrụ na yabụ mwakpo. Ipob kwadoro onwe ụnụ ugo - Ohanaeze Ndigbo Ụnyaahụ Ohaneze dọrọ Ipob aka na ntị, na ọ ga-adị ha mma ma ha kwụsi ịbụ ha ọnọ . Emeka Attamah bụ ọnụ na-ekwuchiri onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo si na ha aghọtaghị ihe mere Ipob na-akatọ ha oge ọbụla, ha kpọrọ otu dị icheiche n'ala Igbo ka ha nye Ipob ndụmọdụ nke ha. Ala amaala jijiji na oshimili Pacific Na mba ofesi, n'akụkụ mba Fiji, ala mara jijiji n'etiti oke oshimili Pacific, mana onweghị onye meruru ahụ na mkpakpa a. Ndị ọkachamara na ihe gbasara ala ọma jijiji adaala obi jụụ makana ha na-ekwu na ụdị ihea agaghị eme ọzọ ebe ahụ nso nso. Mourinho akọọla Man City ọnụ N'egwuregwu, Jose Mourinho bụ onye nchịkọta otu Manchester United ekwuola na Manchester City nwere ego mana ha anaghị eji ego ahụ azụta ugwu. O kwuru nke a maka ihe nkiri Manchester City meputara ọhụrụ nke akpọrọ All or Nothing. O kwuru na ha katọrọ ya na yabụ ihe nkiri. Gee akụkọ anyị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Ọ dị mma di na nwunye inwe otu ọbaego n'ụlọakụ?" afirika-45360144,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45360144,Ọgbaaghara eriela ndụ mmadụ atọ na Saụt Afrịka,Akụkọ ndị dị mkpa,"Mmadụ atọ anwụọla na mba Saụt Afrịka taa dịka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe na Soweto maka ndị mbịara mbịara na-ere ngwa ahịa adịgboroja. Ndị uweojii Saut Afrịka kwuru na ha anwụchiela mmadụ iri abụọ n'asaa ma na-eme nyocha ị chọta ihe malitere okwu a. Akụkọ ọzọ na-ekwu na ọgbaghara bidoro mgbe onye na-azụ ahịa si mba Somalia gbagburu otu nwata nwoke chọrọ i zụ ya ohi. Cheta na ude Saut Afrịka dere na mba Afịrka niile dịka ọgbaaghra yiri nke a mere n'afọ 2008. Na Naịjirịa, End of Twitter post, 1 Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ekwupụtala na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala na 2019. O kwupụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ya na ndị ntorobia chọrọ ịzọ ọchịchị nwere taa bụ Tọọsde. Ọzọ, Ọgbakọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị ịcheịche bụ PACT n'ịchafụ ahọpụtala Fela Durotoye dịka onye ga-anọchịte anya ha n'ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019. Ha kwuputara aha ya taa dịka ha mechara ntụliaka imeụlọ. Fela ekelela mmadụ niile jịkọrọ aka họpụta ya. N'egwuregwu, Onye na-echere Naịjirịa bọolụ bụ Francis Uzoho ekuputala ka obi di ya dịka o bidoro ọrụ ọhụrụ ya n'otu egwuregwu Elche na Spain. Cheta na ọ cheburụ Deportvio La Coruna bọolụ tupu Elche anata ya na mbimbi. Gee nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akukọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47932881,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47932881,Notre Dame Cathedral: Ọkụ agbaala nnukwu ụlọụka Notre Dame,Akụkọ chara akwụ taa:,"Ọkụ agbala ụlọụka Notre Dame Cathedral The fire department said a major operation was underway Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọkụ amabeghị ihe butere ya enwurula n'ụlọụka Notre Dame Catheral dị na Paris, mba France. End of Twitter post, 1 Ndị ọrụ gọọmenti na-ekwu na o nwere ike ọ bụrụna ọrụ e ji n'aka ugbua n'ụlọụka ahụ kpatara ọkụ ahụ . N'afọ gara aga, ụka Katọlik kporo oku ego iji were ruzie ụlọụka ahụ nke na-adakpọ adakpọ. Otu ọnụ na-ekwuru ụlọụka ahụ bụ nke Katọlik kwuru na ihe niile na-agba ọkụ, o nweghị ihe ga-afọ."" Dịka ozi si n'ụlọrụ onyeisiala mba Francce pụta siri kwuo, onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron agbahapụla ebe o kwesịrị ịga gawa ebe ihe mere. A na-arụzigharị Notre Dame Cathedral nke nde kwuru nde ndị njem nleta na-aga ahụ kwa afọ kemgbe a chọpụtara na o nwere akụkụ ya gbawara agbawa. Ihe ị maghị maka Notre Dame Cathedral Ozubulu massacre:Ụlọikpe atọhapụla mmadụ abụọ so na ndị anwụchiri Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 Ka anyị malite n'Anambara ebe ụlọikpe ukwu dị n'Awka tọhapụrụ mmadụ abụọ eboro ebubo na aka ha dị na ọchụ ahụ e gburu na St. Phillip Catholic Church Ozubulu. Okaikpe ukwu bụ Jọstis Fidelis Aniukwu kwuru na ya ahụghị ihe gosiri na aka Chinedu Akpunonu na Onyebuchi Mbanefo dị na ya ọchụ e gburu na ụbọchị isii nke ọnwa August afọ 2017. Ịmachị ndị ọgbatumtum Gọọmenti Anambra steeti nyere iwu ịmechi ọgbatumtum (okada) n'okporoụzọ Ọka na nke Ọnisha site n'ụbọchị mbụ onwa Julaị 2018 Onyeisi ndị uweojii n'Enugu adọọla ndị ọgbatumtum aka na ntị maka ịda iwu etiri gbasara ịgba ọgbatumtum. Ọzọ dịka ibe ya, cheta na mmachị ọgbatumtum ịgba ga-dị n'Enugwu steeti. Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Sulaiman Balarabe enyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie ndị na ada iwu ahụ ma kpachie ọgbatumtum ha ma kpụpụ ha ụlọikpe. Idemmiri na Ghana N'ofesi e, okeide mmiri sitere na oke mmiri zoro ụbọchị ụka na mba Ghana egbuola mmadụ ise ka ya bụ mmiri zochara naanị awa atọ. Seji Saji bụ osote onye isiọrụ National Disaster Management Organisation gwara BBC nke a mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ. Ole Gunnar Solskjaer Onye nkuzi Manchester United N'egwuruegwu, Manchester United akpọpụtala aha dike na dimkpa iri abụọ na abụọ bụ ndị ga-eso sọọ mpi Champions League ha na Barcelona ụbọchị Tuzde na-abịa. Cheta na Barcelona ji otu ọkpụ nyụọ Manchester anya mgbe ha gbara nke agba nke mbụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Woods turu ugo Masters na Augusta National Nke mere ya iko mbụ na-abata ya aka kemgbe afọ 2008. Onweghị tinye maọbu mwepụ ego n'abịa na mmanụ agbịdị Gọọmentị Naịjirịa sị gị dere juu makana ha ekpebibeghị ịwepụ atụmatụ Bekee kpọrọ fuel subsidy. Gọọmentị sị na onweghị ihe ọbụla na-eme ga-akpata ka ewepụ ya ugbua. Gwomgworo bu mmanụ agbịdị agbawala ka ogbunigwe na Gombe Moto na-agba ọkụ Mmadụ iri na abụọ nwụrụ ebe mmadụ iri na isii merụrụ ezigbote ahụ n'ihe mberede a. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe bụ Mary Mallum sị na ọ bụ wa wa wa butere ihe mberede okporo ụzọ a. Ndị agha Sudan na-anwụchịkọ ndị otu Omar al-Bashir Ndi agha napụrụ Omar al-Bashir ọkwa na mba Sudan amalitela ịnwụchịkọ ndị ya na ya so chịa mba ahụ. Ndị agha Sundan mere nke a ka ha ka na-ekwekwa nkwa na ha agaghị achụpụ ndi na-eme ngaghari iwe na mba ahụ. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47426209,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47426209,Presidential Election: Ọ bụ iji maja m kweta kele Buhari- Atiku,Akụkọ dị mkpa,"Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 n'aha PDP bụ Atiku Abụbakar ekwuola na ya anaghị akụja akụja dịka EFCC nwụchiri onye nhazi ego n'ụlọọrụ Babalele Abdulahi. A nwụchiri Abdulahi , onye bụkwa ọgọ Atiku ụbọchị Satode, abali abụọ nke ọnwa Maachị n'Abuja. N'akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Paul Ibe nyere ndị ntaakụkọ, Atiku kwuru na nwanne nwunye onyeisiala Naijiria degara EFCC mkpesa nke mere ha jiri wakpo ụlọ na ụlọọrụ onye nhazi ego n'ụlọọrụ ya mana o nweghị ihe ha hụrụ. Mana Atiku onye kwuru na ha were akwụkwọ ụlọ nwa amadị ahụ, ṅụrụ iyi na ya ""agaghị atufu oku ụmụ Naijiria kpọrọ ya na ntuliaka e mere n'abalị 23 nke ọnwa Febụwarị."" Presidential election 2019: O nweghị mgbe anyị nye ọnọdụ mkpezi- PDP Otu PDP ekwuola na akụkọ na Atiku nyere ọnọdụ ya ga-eji hapụ okwu gbasara onye meriri na ntuliaka 2019 bụ okpokpo asi. Ha kwuru na Atku enweghị ihe maọbụ ọnọdụ a ga-enye ya o were gbahapụ inweta ikpemkwụmọtọ n'ebubo na onyeisiala Muhammadu Buhari mere wuruwuru na ntuliaka emere n'abali 23 nke ọnwa Febuwari. PDP kwuru na ha nwere nke bụ ezigbo mpụtara ntuliaka ahụ nakwa ihe ngosi na APC na Inec gbara okwe nke ha ga-egosipụta n'ụlọikpe. Ehi anyị na-enwe ọṅụ n'ihi mmeri Buhari - Miyetti Allah Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Otu jịkọtara ndị ọchịehi na Naijiria a kpọrọ Miyetti Allah ekwuola na obi na-atọ ndị Fulani nakwa ehi ha ka nnu maka mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na nso nso a. Ha nyekwara Atiku Abụbakar ndụmọdụ ka ọ gawa ụlọikpe ma ọ bụrụ na mkpebi ahụ adịghị ya obi mma. Na mkparịtaụka ha na ụlọ ntaakụkọ 'Sun' nwere, onyeisi otu ahụ bụ Bello Abdullahi Bodejo kwuru na 'Kemgbe izu abụo, anyị anyị akwadola ehi ndị anyị ga-eji mee ụghara maka mmeri Baba Buhari."" "" Ihe anyị na-eche ugbua bụ ntuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti. "" Gọvanọ ndị kwadoro iwu megidere ịchịgharị ehi agaghị alọghachi."" Ụmụnwaanyị APC Imo mere ngagharị iwe Ụmụnwaanyị otu APC n'Imo steeti mere ngagharịiwe n'ụbọchị Satode maka ọrụ a kwụsịrị Rochas Okorocha n'ike n'ụbọchị Fraide. Ha na-ekwu na o nweghị njọ Okorocha mere n'ikwado ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu na ntuliaka na-abịa.. Cheta na otu onye ọkaikpe bụ Anthony Okah ekwuola na oche sineti nke Rochas meriri nwere ike ifunahụ ya ma ọ bụrụ na achụpụ ya n'APC n'ihi nọ bụ ọnọdụ ọ kwụdoro zọọ ọkwa ahụ. N'otu aka ahụ Ngalaba INEC ekwuola na ha ga-emegharị ntuliaka n'ụfọdụ ebe o meghị na mbụ n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị. O kwuru na ebe ndi gụnyere ebe ọgbaghara dapụtara nakwa ebe akụrụngwa Inec nwere nsogbu dị icheiche. Mana onye bụbu odeakwụkwọ APC bụ Timi Frank ekwuola na ọ dịka ịnye ozu ọgwụ. ""Ndị na-efe ala ha agaghị arụ ọrụ ntuliaka n'ebe e nwere ọgbaghara"" Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha. Ngalaba na-elekọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC ekwuola na o nweghi onye otu ha ga-arụrụ Inec ọrụ na-ebe enwere ọgbaghara na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke na-abịa Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba ahụ bụ Adenike Adeyemi kwuru nke a kọwara na o nweghị otu n'ime ha nwụrụ na ntuliaka nke gara aga. Na mba ofesi, Onyeisiala ọhụrụ mba Kongo bụ Felix Tshisekedi ekwuola na ọ chọrọ ịtọghapụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ anwụchiri maka ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime ụbọchị iri. O kwuru na nke a bụ iji kwad oọchịchị onyekwuoucheya na mba ahụ. N'egwurewgwu, Aha Peirre-Emerick Aubameyang nke Arsenal na-ewu na soshal midia maka ọkpụ penariti ọ gbahiere oge ha zutere Tottenham na Satode. Arsenal na Tottenham gbara onwe ha onye laba, onye laba na ya bụ asọmpị. Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Accord na-akwado APGA n'Abia Steeti Onye ji aha pati Acoord azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti bụ Emeka Uwakolam awụsala ọwa n'ịzọ ọkwa ahụ ma dọnyere ogbo ya nke pati APGA bụ Alex Otti ukwu. Uwakolam kwuputara nke a mgbe ọ kpọ ndị na-akwado ya gaa n'isi ụlọọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Alex Otti dị n'Umuahia ụnyaahụ. O kwuru na-agbanyeghi na o nwere ọnụnụọkụ n'obi ijere Abia Steeti ozi na ọ na-enye ohere ka onye nwere ikike karịa ya chịa Abịa. Na nzaghachi Otti kwuru na Uwakolam so na ndị na-azọ ọkwa gọvanọ kachasị sie ike n'Abia Steeti, o kwuru na ya na Uwakolam kwenyere n'otu ihe bụ ịkagbu Papa ukwu na ndọrọ ndọrọ Abia. NTA, AIT, Channels na ndị ọzọ adaala iwu NBC Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi bụ National Broadcasting Commission eriela ụlọọrụ mgbasa ozi dị iri anọ na ise iwu maka ịda iwu na-echekwa mgbasa ozi na Naịjirịa. Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Malam Is'haq Modibbo kwuru na ụlọọrụ ndị a gụnyere NTA, AIT, Channels na ndị ọzọ ga-akwụ ego dị puku narị naịra ise maka ịda iwu a. N'ofesi Ezinaụlọ nwata akwụkwọ mba Amerịka bụ Otto Warmbier onye nwụrụ n'ihi mkpọrọ atụrụ ya na mba Nọt Korịa akatọọla Donald Trump maka ito onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-Un. Nne na nna Warmbier kwuru na onweghi ụdị otito ga-eme ka ha chefuo na ọ bụ ọchịchị ọjọọ Kim gburu nwa ha nwoke. N'egwuregwu Ehihie a ga-ekere ọkụ dịka Tottenham ga-ezute Arsenal, Bournamouth ga-anabata Manchester City ebe Manchester United ga-ele Southampton ọ bịa n'asọmpi Ịnglish Premier. Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ibeawuchi" afirika-45444388,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45444388,#FreeZakzaky: Elzakzaky anọọla abalị 1000 n'aka ndị DSS,Akụkọ dị mkpa taa:,"Tọghapụ Elzakzaky Sheikh Ibrahim Zakzaky Ndị nkwado onyeisi ndị Shiite bụ Ibrahim Elzakzaky pụtara n'igwe n'okporoụzọ Abuja taa, na-akpọ oku ka atọhapụ ya dịka ha na-echeta ụbọchị otu puku ọ nọọrọla n'ọnya ndị DSS. Anwụchiri Elzakzaky kamgbe afọ 2015 dịka eboro ya ebubo na ogburu ndị agha bụ nke ikpe ya ga-abụ ọnwụ. End of Twitter post, 1 Ọ bụghị Alaọmajiji mere n'Abuja - FEMA Ụlọọrụ gbatagbata nke Abụja bụ FEMA akatọọla akụkọ na-ekwu na alaọmajijiji mere n'Abuja. FEMA kwuru na ọ bụghị alaọmajijiji kama na ọ bụ mgbawa okwute nakwa ọrụ ndị na-egwupụta ihe n'ala kpatara nke a. Onye ụkọchukwu a onwere ọdaeshi? Otu ụkọchukwu akpọrọ David Chidiebere kwuru na ya gbanahụrụ ọnwụ mgbe ndị ojiegbe wakporo ụgbọala ya ma wụkwasị ya egbe mana mgbọ egbe atụghị ya n'ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na Chidiebere gwara ya na nke a mere n'ụzọ si Udi gawa Enugwu. Akụkọ si mba ofesi Onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu mba Briten arịọla ndị na-eji ụgbọelu ha eme njem mgbaghara maka mwakpo ndị na-eji igwe Kọmputa ezuohi mere ụlọọrụ ahụ bụ nke metụtara ọbaego ndị ahụ. N'egwuregwu Otu egwuregwu Manchester United akwụsịla mkparịta ụka maka ọdịnihu ha na onye otu ha bụ Paul Pogba kwuo na odochaghị anya ma nwamadị ahụ ọ ka chọrọ ịgbara ha bọọlụ. Cheta na akụkọ na-ekwu na Pogba nwereike ị hapụ Manchester United gawa Barcelona n'ọnwa Jenụwarị nke afọ na-abịa abịa. Nkeji nke abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Iwu ntuliaka 2019 Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị na gọomentị ekwuputala ụjọ ha na 2019 agaghị aga n'ụzọ ziri ezi etu o kwesịrị. Ụjọ ha bụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ikwenye ka a gbanwee iwu ntuliaka nke 2019, dịka ha na-ekwu ka ndị ụlọomeiwu etiti gbaa mbọ kuziere ndị Naịjirịa ihe gbasara iwu a. Uweojii nke steeti Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Femi Falana ekwuola na nhazighari e mere SARS agaghị egbo nsogbu ọrụ ndị uweojii na nchekwa Naijiria. Falana, onye kwuru na mkparịtaụka o nwere na Channels TV ụnyaahụ ka e nwee ndị uweojii nke steeti sịrị na o nweghị mba a na-enwe naanị ndị uweojii etiti. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: '#FSARS asaghị nsogbu ịhazịgharị ọrụ nchekwa ndị uweojii' Na mba ofesi, Ndị obodo Idlib na-eji akụrụngwa awarawa ekpuchi imi ka ha na-atụ anya mwakpo kemịkal a Amerịka ekwuola na ha nwere ọtụtụ ihe akaebe doro anya na-egosi na gọomentị Syria na-akwado ịtụpụta ngwaagha kemịkal n'obodo Idlib. N'egwuregwu, Serena Williams gosiri na ọ kajara akaja dịka ọ pịapụrụ Anastija Sevastova n'ọkara-Ikpeazụ nke asọmpi US Open. Serena ga-ezute Naomi Osaka n'agba ikpeazụ, ebe ọ ga-abụ o merie, o rite nzere 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya. Nkeji taa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Eunice Atuejide na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 apụtala ịkọwa ọnọdụ ya gbasara okwu 'Feminist' o kwuru wuru ewu na soshal midia. Eunice Atuejide Feminist." afirika-45387557,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45387557,Akụkọ kachasị mkpa taa: CAF amapụla ndị ọgba bọọlụ abụọ,"N'egwuregwu,","Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Africa amapụla ndị ọgbabọọlụ Naịjirịa abụọ n'isonye n'asọmpị nke U-17 a ga agba na Niamey maka afọ ha dị karịrị iri na asaa. Naijiria na BurkinaFaso ga-asọmpị echi n'elekere anọ iji mata onye ga-etozu ị ga asọmpị AFCON. Na Delta steeti taa, End of Instagram post, 1 Otu mmadụ anwụọla mmadụ anọ meruru ahụ ebe ụfọdụ ka tọrọ n'okpuru ụlọụka dasara ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka ụtụtụ na Deta steeti. Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Bukola Sararki ekwuola na ya ga-enyeaka chọpụta ma gwọọ ndị pụtara n'ihe a. Ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị Naịjirịa na mba China enweela nzụkọ na mkparịta ụka ụnya ahụ dịka ọ gara mba ahụ. Na nzụkọ ahụ o kwuru na ụjọ anaghị atụ ya gbasara ntuliaka kwụọtọ na 2019 maka na ọ bụ ihe oji banye ọchịchị . Na mba ofesi, Ihe karịrị mmadụ puku iri emela ngagharị iwe n'ihi oge ezumike nka na mba Rọshịa. Gọọmentị mba ahụ na-akwado ịme oge ezumike nka afọ iri isii n'atọ maka ụmụnwaanyị na afọ iri iss n'ise maka ụmụnwoke. N'ụtụtụ AMVCA kpọpụtara ndị ụlọ fiim ụnyaahụ Ndị ihe nkiri si Naijirịa na mba ndị ọzọ n'Afrịka gbakọrọ na Legọs unyaahụ maka emume akpọrọ Africa Magic Viewers Choice Awards. Emume nke afọ a bụ nke isii kemgbe ebidoro ịtụ ndị ihe nkiri ugo site na atụmatụ a. Ndi ihe nkiri zuru ka emee na ya bụ emume ebe ndị tụrụ ugo dika Adekola Odunlade, Omotola Jolade, Nyce Wanueri na ndị ọzọ. Aka m adịghị ya! - Rotimi Amaechi Rotimi Amaechi bụ onye chiburu Rivers steet kwuru na ọbụghị eziokwu na ọ họpụtara onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'APC n'ime Rivers Steeti. Akụkọ na-ekwu na ọ họpụtara Tonye Cole bụ onye ojiegoachọego ama ama, mana Amaechi kwuru na ọ bụ ndị iro na-ekesa akụkọ a. Nd agha Naịjirịa agọọla ebubo Ndịagha Naịjirịa na-ekwu na akụkọ ndị ntaakụkọ AFP dere na ndị Boko Haram gbagburu ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị ole ole gara aga abụghị eziokwu. Ndị agha kwuru na ọ bụ ndị otu ha gbagburu ọtụtụ n'ime ndị agha Boko Haram. AFP dere na ndị Boko wakporo ndịagha Naịjirịa n'obodo Zari n'ime Borno steeti, nakwa gbuo ndị agha ruru iri atọ. US esepụọla aka enyemaka na Palistine Na mba ofesi, goomentị Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị ịnye ego enyemaka ha na-enye ndị Palistine. Amerika kwuru na ha ga-akwụsị ịkwụ ego a ruru nde dọla narị atọ makana Palistine ka na-anabata ọtụtụ ndị agha iyi egwu n'ala ha. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye" afirika-47295363,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47295363,Lassa Fever: Ọrịa a emefuola mmadụ atọ n'Ebonyi,N'Ebọnyị:,"Dọkịnta Emeka Ogah bụ onye nlekọta ụlọọgwụ Federal Medical Center (FMC) dị n'Abakaliki, Ebọnyị steeti, kwuru na ọrịa ịba lasa a kpọrọ ""Lassa fever"" dị ire na steeti ha ugbua. Ogah kwuru na ọnụọgụgụ ndị ọrịa a gburula na steeti ha akarịala anọ bụ ihe ngalaba ""National Center for Disease Control"" kpọpụtara bụ ihe nwụrụ. Kama, Ogah kwukwara na ọ bụ kọmishọna ahụike nke Ebọnyị steeti ka ọ dịịrị ịkpọ okwu a aha. Kọmishọna okwu ahuike dị n'aka bu Daniel Umezuluike, ekwuola na ọ bụ mmadụ iri abụọ (20) butere ya bụ ọrịa n'afọ a. Mana mmadụ 14 bụ ndị a gwọrọla, ebe mmadụ atọ ka na-anata ọgwụgwọ. Mmadụ atọ ndị ọzọ nwụrụ anwụ n'ihi na ebuteghi ha ụlọọgwụ n'oge. O kwukwara na mmadụ iri abụọ a abụchaghị ndị si Ebọnyị, kama na ụfọdụ n'ime ha bụ ndị si steeti agbataobi ndị Ebọnyị makana ọ bụ n'Ebọnyị ka ụlọọgwụ ukwu na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa nje a, nke Bekee kporo ""Virology Centre"" dị. N'Abuja Ndị isi ọchịchị Naịjirịa kpọrọ ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche akpọrọ ""diplomatic community"" na bekee nzukọ, ebe ha nọ gwa ha na agaghị ehigharị ntuliaka ọzọ. Ndị kwuru okwu na ya bụ nzukọ gụnyere Geoffrey Onyeama bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu na otu onye nọchitere anya ngalaba Inec. Dịka ha ka nọ n'ime nzukọ a, ndị na-akwado Ibrahim El-Zakzaky bụ onye ndu ndị otu Shiite e ji n'ụlọmkpọrọ kemgbe afọ atọ na ụma, bịara malite ime ngagharịiwe ebe ahụ. Ha na-ekwu sị tọghapụ onye ndu ha ka o nwere onwe ya. Ndị Ipman ekwuola: Ngalaba na-ahụ maka ndị nọọrọ onwe ha na-ere mmanụ agbịdị akpọrọ Independent Petroleum Markerters Association of Nigeria bụ IPMAN n'aha ịchafụ, ekwuola na enweghi mgbe ha gwara ndị otu ha ree mmanụ ụgbọala ihe na-erughi narị na iri anọ na ise bụ ihe gọọmentị sị ka e ree ya. Igwe e ji ere mmanụ Nke a na-abịa ka ndị mmadụ na-ekwu na e nyere iwu ka ndị na-ere mmanụ ụgbọala ree ya n'ọnụ narị na iri anọ maka nhigharị e higharịrị ntuliaka. A nwụchiela ndị ọrụ kọstọm na Legọs Ụlọọrụ ""Nigerian Customs Service"" kwuru na anwụchiela ndị otu ha mmadụ anọ bụ ndị a kpọrọ aha gbasara mgbagbu otu nwaamadị n'okporoụzọ Lagos-Benin. Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Kọstọm bụ Joseph Attah, gwara ndị ntaakụkọ ""News Agency of Nigeria (NAN)"" nke a, ma gwakwa ha na a ga-akpụpụ onye gburu nwaamadị ahụ ụlọikpe. N'ofesi, Bernie Sanders dị afọ iri asaa na asaa kwuputara na ọ ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka n'afọ 2020, ekwuola na obi siri ya ike na ọ ga-emeri na nke ugbua. Cheta na Sanders nwaburu ike ya inweta ọkọlọtọ ndị Democratic pati na 2016, mana Hilary Clinton napụrụ ya ikike ahụ. N'egwuregwu, Enweghi onye meriri ibe ya ka Liverpool na Bayern Munich zutere na Champions League a gbara n'abalị. Otu ihe ahụ mekwara ka Barcelona na Lyon zutere, mana kedụ onye ga-emeri mgbe otu ndị a ga-agba egbe buru ọ laa n'izu atọ na-abịanụ? Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Nigeria Election 2019: 'Agaghị m atụ vootu makana atụọla ya atụọ'" afirika-45287270,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45287270,Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ndị uweojii egbochiela mwakpo ụlọụka na Jos,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ndị uweojii awụnyela aja na garị ndị na-achọ ịgba otu ụlọụka katọlịk dị na Jos ọkụ. Terna Tyopev na-ekwuchitere ndị uweojii na Platu steeti kọwara na ọ bụ esemokwu dị n'etiti otu ntorobia abụọ butere nke a. O gwara ndị ntaakụkọ na okwu bidoro mgbe otu nwata nwaanyị kwuru na nwoke so n'otu ndị ọzọ metọrọ ya n'ụzọ mmekọahụ. Ndị otu ya gara ịbọ ta ọbọ maka ihe mere onye nke ha, ọgụ esi ebe ahụ bido. Ndọrọndọrọ ọchịchị Atuejide gbadoro ụkwụ n'otu NIP na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019. Nwa ada Enugu steeti na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Eunice Atuejide apụtala ịkọwa ọgbaghara na-eme na pati ya bụ NIP n'ịchafụ. Atuejide kwuru na ọ bụ ndị aghụghọ na-agbalị ịhụ na ọzụzọ ọkwa ya mara afọ n'ala site n'ibo ya ebubo mpụ na nrụrụaka ego. Okwu na-akpọtụ Na mba ofesi Ndị mba Saut Afrịka akpụọla onyeisiala Amerịka Donald Trump n'ala na soshal midia maka okwu o kwuru na gọọmentị Saut Afrịka na-anara ndị ọrụụgbo ndịọcha ala ha ma na-egbu ha. N'Egwuregwu. Aka na-achịkọta otu egwuregwu Leicester city bụ Claude Puel ekelela ọnye ọgba bọọlụ Naịjirịa Wilfred Ndidi dịka Ndịdị binyere aka n'akwụkwọ ọrụ ọhụrụ nke afọ isii n'otu egwu ahụ. O kwuru na Ndidi bụ onye na-agba mbọ nakwa eme ihe ị tụ anya n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-46798616,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46798616,"Forbes: Dangote kachasị, Adenuga na-eso ya na ngụkọ onye ka nwe ego n'Afrika",Akụkọ dị mkpa:,"Aliko Dangote bụ onye nwe Dangote Cement na ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche ichedịka ndị ọgaranya ndị ọzọ na-eme Dịka ngụkọ akwụkwọ akụkọ Forbes siri gosi, Dangote bụ onye kachasị nwee ego n'Afrịka dịka o nwere ihe ruru ijeri dọla iri na ụma ($10.3b). Ebe onye na-eso ya bụ Mike Adenuga, onye nwere ijeri dọla itoolu na ụma. End of Twitter post, 1 Mana Dangote ji ijeri dọla abụọ gbatuo n'ihe ọ dara n'afọ gara aga, n'ihi ọnụ Dangote Cement n'ahịa ego Naijiria dara ada, mana Mike Adenuga si na ijeri dọla ise ọ dara n'afọ gara aga gbalite ihe ọ dara. Ndị ọzọ bụ: 3. Nicky Oppenheimer - $7.3 billion 4. Nassef Sawiris - $6.3 billion 5. Johann Rupert - $5.3 billion 6. Issad Rebrab- $3.7billion 7. Nagruib Sawiris $2.29 Billion 8. Koos Bekker $2.3 billion 8. Isabel dos Santos $2.3 billion 8.Strive Masiyiwa $2.3 billion 8. Patrice Motsepe $2.3 billion Adekunle Gold and Simi Wedding: Ọ bụ gịnị ka e jiri kpụrụ ha n'ọnụ? Akụkọ kpọtụrụ ụbọchị Wenezde bụ alụmdịnanwunye mere n'etiti otiegwu Adekunle Kosoko a ma ama dịka Adekunle Gold, nakwa ogbo ya bụ Simisola Bolatito Ogunleye, onye ama dịka Simi. Adekunle Gold na Simi mere alumdinanwunye nzuzo ebe ha kpọrọ naanị ndị enyi ha mmadụ narị atọ oku gụnyere ndị ama ama na Naijiria. E ji egwu, ""Sade"" nakwa ""Orente"" mara Adekunle Gold, ebe e ji ""Jamb Question"" na ""Love Don't Care"" mara Simi. Ozi pụtara bụ na ndị egwu abụọ a hiwere ụbọchị agbamakwụkwọ ha n'otu ụlọoriri dị na Victoria Island, Legos ebe ha kpọrọ naanị mmadụ narị atọ bịa soro ha nụrịa. Akụkọ alumdinanwunye ha kpanyere ọkụ na soshal midia. Ụfọdụ na-ekwu na alumdinanwunye ha ga-agbawa Falz, onye ọzọ na-eti egwu, obi. Falz n'onwe ya tinyere foto nwata anyammiri na-apụ n'anya n'igwe ogwu Twitter ya dịka akụkọ ahụ na-ewu. Ndị mmadụ na-esi imi n'ala ịhụta foto maọbụ onyonyo ihe mere n'emume ahụ. Ndị ihe ha na-amasị dịka @ịamogpaschal na-ekwu na o meghị ha na mberede n'ihi na ha matara na o nwere ihe na-aga n'etiti ha. #Amaechitapes Gọọmentị etiti ekwuola na iwepụta ihe e kwuru bụ olu Rotimi Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem, ebe ọ na-akatọ gọọmentị, agaghị ebute ọgbaghara n'etiti ndị APC. Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015 Ebe ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa na gọọmentị etiti enweela nkwekọrịta na Onyeisiala Buhari ga-ezigara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ha ga-etinye n'iwu, nke ga-eme ka a malite ịkwụ puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe, n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke Jenụwarị a. N'akụkọ ọzọ, Osinbajo chọrọ iwu ga-ejichi soshal midia Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọ ga-adị mma iwepụta iwu ga-achịkwa igwe okwu soshal midia iji beleta nsogbu akụkọ ụgha. Osinbajo onye kwuru nke a n'ọgbakọ akụkọ ụgha nke BBC hiwere n'Abuja n'ụbọchị Wednesde kwuru, ""ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere gbasara akụkọ ụgha, o nweghịzị ihe a ga-ekweta na ọ bụ eziokwu n'obodo Naịjirịa."" Jamb ekwuola na ndị nwere nsogbu 'biometrics' ga-anọ n'ụlọrụ ha mee ule ha Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Ngalaba na-ahụ maka ule ịbanye mahadum bụ Jamb enyela iwu na ụmụakwụkwọ nwere nsogbu banyere ihe e jiri mara onye nke a kpọrọ biometric data' ga-eme ule nke ha n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ọnụ na-ekwuru ndị Jamb bụ Fabian Benjamin kwuru na nke a bụ iji gbochie ndị ji aghọghọ na-ekwu na ha enweghị nwụ ike idebanye aha ha iji nwe ohere iti mkpu ka e higharia ule nke ha. N'ofesi, Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa Ụlọọrụ Kọmishiona mgbasaozi nke mba Briten adaala ụlọọrụ Cambrige Analytical nha maka kpụ ụkwụ n'ala na'ịkwụ nha puku paụnds iri na ise maka ịda iwu ichekwa akara ndị mmadụ (data protection Act. Ebee ka Victor Moses kwụ akwụ? Dịka ọgba bọọlụ Naijiria bụ Victor Moses gara ezumuike site n'ịgba bọọlụ mba ụwa, ọnọdụ ya edozighị anya dịka o nwere ike ịhapụ otu Chelsea. Moses gbara Chelsea ofuma na afo bọọlụ abụọ gara aga oge Antonio Conte na-achịkọta Chelsea. Mana n'afọ ọhụrụ a, ọ pụtara naanị ugboro abụọ n'ime asọmpi iri abụọ na otu nke premier league,dịka onye nchịkọta ha ugbua bụ Maurizio Sarri, sị na ya amaghị ije ya. Ndị agha Naịjirịa atọghapụla onye ntaakụkọ Daily Trust bụ Uthman Abubakar, ha nwụchiri n'ụlọọrụ ha na Maiduguri, mana ọ ka fọrọ. Onyeisi ụlọọrụ Daily Trust bụ Mannir Dan-Ali, kwuru na ndị agha ka ji ekwentị Abubakar nakwa kọmputa ya. N'ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ka na-ebe akwa ego o ji arụ mgbidi ahụ aja ọ chọrọ iji egbochi ndị mbịarambịara ịbata na mba ya. Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha N'ihe bụ okwu mbụ ọ na-agwa ndị mba ya n'ihe nkiri n'afọ a, Trump kwuru na a ga-esi n'ihe a kpọrọ North American Free Trade Agreement kwụọ ụgwọ mgbidi a. N'egwuregwu, Mohamed Salah nke Ijipt atụrụla ugo dịka ọkaibe n'egwu bọọlụ Afrịka. Ebe otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa zọrọ Naịjirịa ihu site n'inweta nturu ugo mba bụ ọkaibe n'Afrịka na nturugo CAF. Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị Chukwuemeka Afigbo na-arụ na Facebook chọrọ ka ị mụta etu esi abụ ọkaibe n'ihe gbasara teknụzụ. 'Etu ị ga-esi kwalite ọrụ teknụzụ gị'" afirika-43794241,https://www.bbc.com/igbo/afirika-43794241,EFCC anwụchiela ndị Swiss Golden maka igwu ndị mmadụ,Swiss Golden eruola njedebe,"Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a: EFCC na-alụ ọgụ megide mmerụaka na ala Naijiria EFCC anatala ihe ruru naira nde narị abụọ na iri n'isii bụ ego ndị Swiss Golden ghọgbutere n'aka ụmụ mmadụ Ha nwụchikwara ndị Naịjiria abụọ na otu onye Rọshịa na Lagos ma buru ha ga ba Kano maka nyocha zuru oke. End of Twitter post, 1 Dọkịta adigboroja na Legos Ndị uweoji nwuchiri otu nwoke bụ dọkịta adịboroja na-edenye ndị mmadụ ọgwụ na Legos. Nwoke ahụ bụ onye Borno steeti agụchaghị ụlọakwụkwọ Primarị. Ndị uweojii sị na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe. N'egwuregwu, Ndi nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Commonwealth emere na mba Australia, ga-alọghachite Naịjirịa n'ụtụtụ echi. Ha ji ihe nrịta dị icheiche ruru iri abụọ na anọ alọta. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Facebook a ga-aga ụlọịkpe ọzọ? Otu onye ọkaikpe n'obodo California ekpebiela ka Facebook ga-aga ụlọikpe maka ịjị teknụzụ a kpọrọ 'Facial Recognition' achọkọta akụkọ gbasara ndị mmadụ n'agwaghị ha Facebook ekwuola na ha jụrụ nke a jụ ma na-ekwu n'onweghị iwu ha dara. Nkeji ụtụtụ a: Gere akụkọ nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkịrị nke taa Ihe onyonyo a gosiri ebe onye ọkpaọchị , Josh2funny, na-akọwa akaọrụ ya 'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny" afirika-47088189,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47088189,Victor Moses enyeela goolu mbu ya na Turkey,Akụkọ dị mkpa,"Victor enwerela ọkụ bịa Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na mba ofesi bụ Victor Moses jị ọkpụ goolu gwa ndị Turkey na ya abịara. Moses si Chelsea gawa otu bọọlụ Fenerbache nyere goolu ya n'ime nkeji iri ọ batara ọgbo egwuregwu. Ihe mere taa Osote Onyseisiala Naịjirịọ bụ Ọkammụta YemiOsibanjo jiri nwapem gbalahu onwu taa dịka ụgbọelụ helịkọpta bu ya ta dara n'ike n'ogbọ egwuregwu dị na Kabba Kogi steeti. Osinbajo ezipụla ozi na ahụ dị ya mma site n'akara Twitter ya na-ekwa kwa na o kwenyere na Chinke ga-echekwa ha n'oge a. Atiku Abubakra bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP ezigarala Osinbajo ozi itiakanobi site n'akara Twitter ya. Ndị Igbo kwanyere Ekueme ugwu Igwe obodo Oko dị na Anambra steeti ekelela ndị mmadụ pụtara ị kwanyere nwanne ya Alex Ekwueme ugwu dịka a na-eme emume ncheta olili ya taa n'Oko. Obi na-achị ọnịcha nakwa Mazi Solo nọchitere anya aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano gụnyere na ndị nnukwu mmadu bịara ya bụ emume. Na mba ofesi Ndị na-akwado onye kpọrọ onqw ya onyeisiala mba Venezuela bụ Juan Guaido ebidola ngagharịwe taa dịka ụfọdụ mba ndị Yurop na-akwanye Nicholas Maduro ọkụ n'ike ka ọ mee ntuliaka ọhụrụ. Akụkọ BBC na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọgbaghara ọ daala n'Ohaneze? Akụkọ na-eru BBC ntị bụ na nkwado Ohaneze Ndịgbo nyere onye na-azọ ọchịchị n'okpuru patị PDP bu Atiku Abubakar ebutela ogbaghara n'etiti ya bu ọtụ. Ka ọkwụ ugbua, Uche Okwukwu bụ ode akwụkwọ Ohaneze na-akọwa na enyerela onyeisi Ohaneze bu Nnia Nwodo ezumike. Mana Uche Okpaga bụ bụ ode akwukwọ mgbasa ozi si na ọbụ Okwukwu ka enyere ya bụ ezumike. Mwakpo Boko Haram Ndị Boko Haram gburu ihe ruru mmadụ iri isi n'obodo Rann di na Borno steeti ụbọchị Monde nke isu a. Nke bịara n'azụ ndị agha Naịjirịa hapụrụ ha bụ obodo ka Boko Haram wakpochara ya. Eborogọvanọ Virginia oke agbụrụ Aka na-achị steeti Virginia dị na mba AmerỊka bụ Ralph Northam na-arịọ mgbaghara maka foto otinyere n'akwụkwọ mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ n'afọ 1984. Foto ndị na-ewe ụtụtụ mmadu iwe makana ha sị na ọ na-akwado oke agbụrụ emela ka ọtụtụ sị ka Northam rituo n'ọkwa dịka GỌVANỌ N'egwuregwu, Ọ ga-akpọtụ na Legọs taa n'emume ọsọ akpọrọ Lagos City Marathon na Bekee. A na-eme Lagos City Marathon kwa afọ. Nke a bụ afọ anọ ya. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ndị Awụsa bi Ebonye pụtara ịkwado Atiku" afirika-46168806,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46168806,Awakpoola Atiku n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja - PDP,Akụkọ dị mkpa,"Awakpoola Atiku - PDP Otu Peoples Democratic Party (PDP) edepụtala akwụkwọ ozi ebe a na-ebo ebubo na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nwakporo onye jị ọkọlọtọ ha n'aka bụ Atiku Abubakar n'ọdọ ugbọelu taa bụ Nuvemba 11 n'Abuja. PDP ga n'ihu kwuo na ndị nche a banyere n'ime ụgbọelu Atiku nakwa kposasi ebe niile n'ime ụgbọelu a na-acho ihe ekweghi ikpọ aha. Ha kwukwara na ha lebere anya na ekwenti Atiku nakwa akwụkwọ dị iche iche o ji eme nkwadebe maka ntuliaka 2019. Ebola Ọrịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ narị abụọ n'afọ a na mba DR Congo dịka ndịọrụ ahụike mba ahụ si kwuo. Ndị ọrụ ahụike DR Kongo ebidola ịgba ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ịhụ ma ọ ga-ebelata ọnwụ site n'ebola Ebola nke malitere ọzo n'ọnwa Julaị nke afọ a na-eme ya ugboro iri ọrịa a na-ewelite isi na mba ahụ kemgbe afọ 1976. Ncheta agha mbaụwa nke mbụ A na-eme emume ncheta agha mbaụwa nke mbụ nke Bekee kpọrọ ""World War 1"". Emume a ndị mba Briten nakwa mba Frans na-eme nke a kpọrọ ""Armistice Day"", bụ iji cheta ndị lụrụ ọgụ na ya bụ agha. Ndịisiala ọtụtụ mba agha a metụtara, gụnyere Donald Trump na Vladimir Putin nakwa Muhammadu Buhari na ihe ruru iri isii ndị ọzọ, so bịara Frans mgbaru maka emume a. Na Folkstone, ebe ndị mmadụ gbakọrọ ịhụ eserese Wilfred Owen bụ ọma mbem agha Na ya bụ emume, ndị mmadụ ga-ada nkịtị nkeji abụọ, iji kwanyere ndị nwụrụ n'agha ugwu. Otu nwaanyị nwetara ohere mabanye aka n'ime ụgbọala bu Trump n'agbanyeghị ndị nchekwa gbara ya gburugburu. ""Operation Lafia Dole"" Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Texas Chukwu, ekwuola na ngalaba ""Operation Lafia Dole"" enwetala onyeisi ọhụrụ aha ya bụ Major General Benson Akinroluyo. Nke a na-abịa ka e wegharịrị ndị agha gụnyere Major General Abba Dikko bụbụ onyeisi ""Operation Lafia Dole"". Dikko ga-abụzi onyeisi ngalaba a kpọrọ ""Civil Military Affairs"". Oshiomhole Onyeisi otu pati APC bụ Adams Oshiomhole, ekwuola na enweghị nwụchi ọbụla ndị ọrụnchekwa DSS nwụchiri ya. Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 O kwuru na n'ezie ọ hụrụ ndị DSS otu ugboro, mana ọ bụ maka ịkpa nkata, na ọ bụghị nwụchi. Ọkụ Kalifọnia Oke ọkụ na-ere ere bidoro n'obodo Kalifọnia ụbọchị ole na ole ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise dịka ndị mba Amerịka si kwuo. N'egwuregwu, Ndị otu Leicester City agbaghị aka ahịa ka ha zutere otu Burnley na be ha. Kama, ha na ndị na-akwado ha mere ndị mmadụ echeta ebewe site n'etu ha si mee ncheta onye nwe ha nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta izu abụọ gara aga. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ndị ishi na-agụ egwu" media-46258575,https://www.bbc.com/igbo/media-46258575,Cameroon: Ndị ntọ atọọla ụmụakwụkwọ ọzọ ruru 20,Akụkọ dị mkpa,"N'Afịrịka ndị ntọ atọọla ụmụ akwụkwọ iri abụọ n'ụlọakwụkwọ Lords Bilingual Dị n'obodo Kumba, nke dị na ọwụwa anyanwụ Kamerun. BBC chọpụtara na a tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị 20 n'ime ọnwa Nọvemba. Ndị uweojii kwuru na ugbua ha na-eleba anya na yabụ mkpamkpa. Onwebeghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a. Onweghị akara anyị zuru - APC Onyeisi mgbasa ozi maka achụmnta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari, bụ Festus Keyamo ekwuola na ebubo na ha zuru akara ""NextLevel"" ezu bụ ụgha. Cheta na ihe na-akpọtụ na soshal midia bụ ebubo a na-ebo na APC kọpịrị akara njirimara ụlọakwụkwọ mahadum dị n'Amerịka wee mee akara ozi ịchụnta vootu ha. Ihe mere m jiri gụọ Chizoba - Paul Okoye Paul Okoye gwara BBC Igbo na ọ gụrụ egwu ọhụrụ ya bụ Chizoba makana ọ chọrọ ịkpalite mmọ ndị na-kwado ya. Okoye kwuru na o tiri egwu a kamgbe otu afọ gara aga, ma kwukwa na ya bụ otiegwu nke mere na ọ ga na-agụ ihe ọbụla metụta ya n'obi. Biko gaa nụ na websait anyị bbcigbo.com ka ịnụta ihe niile Paul gwara anyị. Ogbunigwu egbuola mmadụ 43 na Kabul N'ofesi, otu onye yi ogbunigwu n'ahụ egbuola onwe ya na mmadụ iri anọ na atọ ndị ọzọ n'obodo kabul na mba Afghanistan. Ndị gbatagbata kwuru na ugbua, onweghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a. Cahill agaala ezumike nka Tim Cahill bụ ọgba bọọlụ mba Australia agaala ezumike nka. Cahil dị afọ iri atọ na asatọ, gbara asọmpị ya nke ikpeazu n'ime asọmpị Ọstralia na Lebanon gbara. Ọstralia ji ọkpụ ato merie Lebanon. Gee nkeji n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Okwu Uche Nwosu Ịkwe n'aka ofesi Naịja, Legọs Adebanjo, Soyinka na Nwodo Ndị Naijiria nwere agba gụnyere; Wole Soyinka, Ike Nwachukwu, Nnia Nwodo nakwa onye okenya otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo ekwola na o nweghị ihe ga-egbochi ihazigharị obodo Naịjirịa na mpagghara, na mpaghara. Ha kwuru nke a na nzuko ụmụnna Aka ikenga kpokobara na Legos ụnyahụ nke a kpọrọ 'Handshake across the Niger. PMB Ekelela ndị ụka Alakụba na Eid-El-Maulud Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela ụmụ Naijirịa ndị na-ekpe ụka Alakụba ụkpa ekele maka emume nke Eid-El-Maulud bụ ụbọchị ncheta Prọfet Muhammed. Ọkụ agbala ụlọọrụ EFCC dị na Wuse 2, Abuja n'abalị ụnyahụ ka ọ kụchara Elekere Asaa dịka onye ọrụ ndị ụlọọrụ a bụ Kayode Oyetunde sị kwụọ. Nrụrụ aka Richard Akindele Richard Akindele bụbu onye nkuzi na mahadum Obafemi Awolowo, Ile ife Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo atụbala ọkammụta Richard Akindele na mkpọrọ maka ikpe ịchọ ịdịna nwaakwụkwọ aha ya bụ Monica Osagie ka o were bufee ya n'ule akwụkwọ. Supa Lig Aleksander Ceferin bụ onyeisi Uefa N'egwuregwu, onyeisi ndị Uefa bụ Aleksander Ceferin na ogbo ya bụ Andrea Angnelli agọọla aka na ụkwụ na o nweghị mgbe ha ji cheta echiche iwepụta lig ọzọ a kpọrọ supa lig. Lee ihe nkiri anyị ebe Chike Ukaegbu: O nweghi ihe jịkọrọ ndị kara nka na ọdịnihu anyị" afirika-45506122,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45506122,Akụkọ kachasị mkpa: 'Dozienu ụzọ ụgbọelu Enugwu' - Ndị ọkwọụgboelu,Akụkọ ndị dị mkpa,"Ndị ọrụ na-akwọ ụgbọelu na Naịjirịa arịọla ngalaba na-elekọta ọdọụgboelu ha dozie okporo ụzọ ụgboelu nke odọụgboelu Enugu na Benin. Ha kwuru na ọ bụrụ na-emeghị nke a, na ọ ga-ebute ihe mberede n'oge adịghị anya. Ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari nwetara nkwado otu pati ya Bụ APC ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 Otu APC ekwuola na amụma ụlọọrụ abụọ ndị nke sị mba Briten bụ HSBC na 'The Economist' buru maka Buharị bụ amụma ụgha nke enweghị eziokwu dị ya. Economist kwuru na Buhari agaghị emeri na 2019 ebe HSBC kwuru na akụnaụba Naịjirịa ga-akụ afọ n'ala ma Buhari merie. Na mba ofesi Ndị uweojii ekwuola mmadụ isii nwụrụ dịka otu nwoke ji egbe gbagburu ha n'obodo Bakersfield nke dị na California na mba Amerịka. Ha kwukwara na nwoke ahụ a mabeghị aha ya gbagburu onwe ya mgbe ndịuweojii na-akwado ịnwụchi ya. N'egwuregwu, Otu ụlọikpe na mba Britain amachiela onye nche bọọlụ otu Tottenham bụ Hugo Lloris ịkwọ ụgbọala n'afọ abụọ ma daa ya nha puku pounds iri na abụọ. Cheta na ndị uweojii jidere ya ebe ọ na-akwọ ụgbọala ebe mmanya na-egbu ya. Gee Nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-46218841,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46218841,Ụlọịkpe mkpegharị ebelatala afọ ole Dariye ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ,Akụkọ dị mkpa taa,"Otu ụlọịkpe n'Abuja ebelatala afọ ole aka chịbụrụ Platu steeti bụ Joshua Dariye ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ. Cheta na-atụrụ Dariye nga n'ọnwa Juun afọ a mgbe ikpe mpụ na nrụrụraka egọ mara ya. Ozo, Otu APGA n'Anambra steeti ekwuola na ha kwudosi ike n'ọchụchụ achụrụ ndị omeiwu atọ n'ọrụ ụnyaahụ. Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ndị omeiwu ahụ kpara nkata chutu Rita Maduagwu emeghi ya n'ụzọ kwesiri. Nke a pụtara na ha dara iwu. Na mba ofesi Ndị uweojii na mba Congo agbagbuola ụmụakwụkwọ abụọ n'isi obodo ha bụ Kinshasa ebe ha na-eme ngagharị iwe. Ụmụakwụkwọ ahụ si Mahadum Kinshasa na-eme ngagharị iwe maka ndị nkuzi gbara abụbọ ọrụ n'ihi ụgwọ ọnwa ha. N'egwuregwu Dịka otu eguwregwu Naịjirịa na-akwado izute Bafana bafana nke sawt Afrịka echi, Ahmed Musa ekwuola na ha dị njikere maka asọmpị a. O gwara ndị ntaakụkọ na obi ruru ha niile ala. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Onye ndu IPOB na mba ofesi bụ Paul achala akatọọla okwu onyeisi ọhaneze ndị Igbo bụ Nnia nwodo kwuru. Achalla kwuru na o nweghị onye na-anụ ọgụ ọzọ kama na ihe ndị otu Ipob chọrọ nye ndị Igbo ohere ka ha tụọ vootu referandum gosiri ebe ha kwụ. Ọ gwara BBC Igbo na onweghị ihe IPOB ji okwu Nnia Nwodo e mee makana ọ na-ekwuru onwe ya. N'onụ ya, ""anyị kwetere na Ọhazurume karịa onye kwụ nanị otu onye ị bịa na-ekwu ihe ọ na maghị."" Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na ndị Igbo agaghị eji ngwa egbe alụ ọgụ ọzọ iji nwete mwereonwe Biafra. O kwuru nke a n'emume mpụta n'akwụkwọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'Anambra Steeti. Nwodo kwuru na ọ bụ agha Biafra butere ọnwụ ọtụtụ nde ndị Igbo ma lakwa akụnaụba ha n'iyi, ọ rụtụrụ aka na ọnụọgụgụ a na-enye n'akwụkwọ akụkọ abụghị nke ọma ya n'ihi na enyeghi etu esi agụkọ ya. Buhari saa anya gị maka ndị gọvanọ ọjọọ - NLC Otu jikotara ndị ọrụ na Naịjirịa adọọla onyeisiala Muhammadu Buhari aka na ntị ka ọ kpachapụ anya maka ndị gọvanọ na-emegide ndị ọrụ na Naịjirịa. Onyeisi ha bụ Ayuba Wabba kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ na-achọ imebi mkpebi ndị ọrụ na Gọọmentị etiti nwere n'ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra iri atọ. Mkparịta ụka ASUU na Gọọmentị etiti Mkparịta ụka mere n'etiti gọọmentị etiti na ndị nkuzi Mahadum na Naịjirịa n'ihi abụbọ ọrụ amịtabeghi mkpụrụ ọbụla dịka ebufere izuụka ọzọ. Ndị nọ n'isi oche mkparịta ụka ahụ gụnyere minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na onyeisi ndị nkuzi mahadum bụ Biodun Ogunyemi. Na Kalifonịa Ihe karịrị mmadụ narị isii ka na-efu efu n'ọkụ ọgbụgba na-agba na mpaghara ukwu nke Kalifonịa ebe ahụla ozu mmadụ asaa ọzọ. Onye ọrụ n'ogige ahụ bụ Kory Honea kwuru na ihe ize ndụ so ọkụ ọgbụgba ahụ emeela ka a ghara ịmatacha ọnụ ọgụgụ ndị na-efu efu. N'egwuregwu Alex Iwobi, Kelechi Iheanacho na Ahmed Musa ga-ebu ndị Super Eagles gaa asọmpi itozuoke Iko mba Afrịka ha na ndị Saụt Afrịka ga-agba.b Cheta na n'afọ 2017 ndị Saụt Afrịka gbara Super Eagles ọkpụ abụọ n'ọgbọ egwuregwu dị n'Uyo. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ihere adịghị na nwoke ị mee nwaanyị mbọ -Onyedika" afirika-45795039,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45795039,Madumere: Okorocha chọrọ onye ọ ga-eji na-eti okwe,Eze Madumere asaala Rochas Okorocha.,"Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Madumere kwuru na ihe Okorocha ji esi ọnwụ itinye ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka gọvanọ Imo steeti. Gee ihe o kwuru n'ụju n'ihe onyonyo a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:" afirika-47535338,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47535338,"Ethiopian Airlines: India, UK na ndị ọzọ amachiela Boeing 737 Max",Akụkọ dị mkpa,"Mba Briten na mba Yurop ndị ọzọ amachiela ụgbọelụ 737 max niile ife na mba ha dịka ụgbọelu ahụ kpọkasiri n'ụtụtụ ụbọchịụka. Nke mere ya ugboro abụọ ụdị ụgbọelu a na-akpọkasị n'ime ọnwa ise. Ihedịọha: ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo Onye merịrị na ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Chukwemeka Ihediọha ekwela ndị Imo nkwa na n'oge nke ya, ""ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."" Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n'Owere ụbọchị Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu. INEC kpọpụtara Ihedioha dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti emere n'abali itolu nke ọnwa Maachi. Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua. N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntuliaka ahụ. N'egwuregwu, Aka chịburu Manchester United bụ Louis Van Gaal alaala ezumike nka ka ọ dị afọ iri isii na asaa. Ọ chịkọtara ụfọdụ otu egwu bọọlụ gụnyere Bayern Munich, Ajax, Barcelona na mba Nertherlands. Akụko BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'Afrịka Ngagharịiwe ndị mba Ọljiria akwụọla ụgwọ makana onyeisiala chịrịla ha afọ iri abụọ bụ Abdelaziz Bouteflika, ekwetala ịhapụ ọchịchị ọ chọburu ịchị nke ugboro ise. N'otu aka ahụ, Bouteflika dị afọ 82 higharịrị ntuliaka ha kwesịrị ime n'ọnwa Epreelụ. Cheta na ndị mba ya mere ngagharịiwe gafere izu abụọ, ebe ha na-achọ ka ọ rịtuo n'ọkwa ma ghara ịzọ ọchịchị ọzọ dịka ọ chọburu. Emeka dị ọha Imo mma Ndị Imo steeti ekwuola na Emeka bụ Ihe dị ọha mma ka ngalaba INEC kpọpụtara aha Chukwuemeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti. Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua. O kwere ndị Imo nkwa na n'oge nke ya ""ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."" Emeka Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n' Owere n'ụtụtụ Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu. N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntualaka ahụ. N'akụkọ yiri ya, INEC agụnyekwuola ntuliaka e mere na Kano n'ime ise ndị ha kwuru na mpụtara ya ezughi ezu igbanwe ntuliaka nke bụ ""inconclusive"" na bekee. N'akụkọ si mba ọzọ, Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba US bụ FAA, agwala ndị ụlọorụ njem ụgbọelu na enweghi ihe ha chere na-egbochi ụgbọelu Boeing 737 Max 8 ife n'elu, n'agbanyeghi na ụdịrị ụgbọelu ahụ akpọkasịala ugboro abụọ n'ime ọnwa isii, ma gbuo mmadụ narị atọ na iri anọ na isii. Ka ọ dị ugbua, mba Sịngapọ akwụsịla ụdịrị ụgbọelu Boeing 737 ahụ ifebata maọbụ ifepụ na mba ha, dịka ụfọdụ ndị ụlọọrụ njem ụgbọelu gụnyere Ethiopian Airlines, Cayman Airways nakwa Comair machiri nke ha. N'egwuregwu, Ọ bụ n'aka Zinedine Zidane ka inyeaka ndị Real Madrid ga-esi bịa? Ajụjụ a welitere isi ka Zidane lọghachịtara ịchị Madrid ọzọ n'ime ọnwa iri o ji pụọ, nke bụ na a chụọla Santiago Solari na-achịkọtabu ha, ụkwụ eru ala. Akụkọ dị mkpa n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ga-amasị gị: 'Agaghị arụnwu arụrụala na ntuliaka nke ugbua' - Okorie" afirika-45332887,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45332887,Mba Asịa bụrụ ndị Naịjirịa ọkụ mụọ - Nwaanyị ọgo ya nwụru na Malaysịa,Akụkọ ga-amasị gị,Diana Samantha Esemene gwara BBC Igbo na-akpọmasị agbụru so n'ihe butere ọnwụ ọgọ ya nwoke na Malaysia. 46956869,https://www.bbc.com/igbo/46956869,Lassa Fever Outbreak: Ọrịa Iba Lasa awakpoola Naịjirịa ọzọ - NCDC,Akụkọ dị mkpa:,"Ngalaba na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa na-efe efe akpọrọ NCDC n'ịchafụ ekwuola na ọrịa Iba Lasa awakpoola ala Naịjirịa ọzọ. N'ime akwụkwọ ozi ha ziputere ha kwuru na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ arịala elu kemgbe afọ 2019 bidoro. Ha kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii si na steeti asatọ bụ ihe bu ọrịa a. Steeti ndị ọ metụtara bụ Ebonyi, Edo, Ondo, Bauchi, isi obodo Abuja, Platu nakwa Taraba. Ọgbakọ ndị chịbụrụ ekwetala ka a kwụọ 27,000 ụgwọ opekatampe Na nzụkọ ha mere n'Abuja ụbọchị Tuzde,ndị chịbụrụ na ndị na achị ala Naijiria nke a kpọrọ, 'National Council of State na bekee akwadola ka gọọmenti etiti bido kwụwa N27,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe. Otu jikọrọ ndị ọrụ na-etibu mkpu ka akwụwa ha N30,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe. Gọọmenti chọrọ ka Onnoghen tinye akwụkwọ arụkwaghịm Gọọmenti etiti ekwupụtala mmasi ya ka Ọkaikpe Ukwu Naijiria bụ Walter Onnoghen rituo n'ọkwa ya. Aliu Umar, onye bụ okpe ikpe gọọmenti etiti (Chief prosecutor), kwuru nke a ụbọchị Tuzde n'ikpe Onnoghen n'Abuja sịrị na e degarala Onnoghen akwụkwọ mana ọ maghị ma ọ natakwara ozi ahụ ka ọ bụ na ọ nataghị ya. Jọstis Walter Onnoghen, ọkpaikpe ukwu Naijiria abịaghị ikpe ahụ. Onnoghen na-azara ọnụ ya maka ebubo ekwupụtaghị akụnaụba ya niile kemgbe ọ batara n'ọkwa Ọkaikpe ukwu na agbanyeghị na o megidere iwu Code of Conduct Act. Wole Olanipekun, onye na-edu ndị ọkaiwu na-ekpechitara Onnoghen kwuru na ọnnoghen abịaghị ikpe ahụ n'ihi ikpe ndị a gbarala ụlọikpe CCT banyere okwu ahụ. N'izuụka gara aga, otu ụlọikpe ukwu nyere mkpebi ka a kwụsịtu ikpe Onnoghen mana ndị na-akwado gọọmenti kwuru na o nwere ka ọ dị. N'egwuregwu, Ụwa niile na-atụ egwu na otu onye ọgbaa bọọlụ mba Briten bụ Emiliano Sala anwụọla dịka ụgboelu bu ya aga Cardiff furu efu n'eli igwe. Ndị ọrụ nzọpụta na mba Briten ebidola ịchọ ya ma n'elu igwe ma n'ime mmiri. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Afe Babalola chọrọ ka a na-eme ule mpụta na mahadum Afe Babalola bụ onye nwe Afe Babalola University dị n'Ondo steeti Otu onye nwere mahadum na Naijiria bụ Afe Babalola akpoola oku ka a na-enwe otu ule maka ndị niilenọ n'afọ ikpeazụ na mahadum. Babalola,onye kwuru nke a n'emume ịnabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ e mere na Mahadum ya bụ Afe Babalola University n'Ado-Ekiti, Ekiti steeti kwuru nke a ga-enye aka ikwalite ezi agụmakwụkwọ na Naijiria. Ọgbakọ gọọmenti etiti na ndị ọrụ nkuzi mahadum mere Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ọgbakọ gọọmenti etiti na ndị ọrụ nkuzi mahadum mere n'abali Monde amitaghị mkpụrụ dịka enweghị nkwekọrịta ha nwere. Onyeisi otu Asuu bụ Abiodun Ogunyemi gwara ndị ntaakụkọ na ' nzukọ ahụ ebighị okwu"", na ha na- alọghachi ka ha na ndị otu ha kpa na ọ bụ mgbe ha kpachara ka ha ga agwa ọha ihe ha kpebiri. Mkaprịtaụka Obasanjo na BBC Atiku ka Buhari mma-Obasanjo Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Onye bụ onyeisiala Naịjirịa ochie bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na agbanyeghị na Atiku Abubakar abụghị onye nsọ, na ewepụta Buhari na Atiku ọ ga aka mma ị hara Atiku. Obasanjo kwuru nke na mkparịtaụka ya na BBC nwere kwuru na , ""Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghị ọrụ ma ncha, ịkpa oke, nrụrụaka, adịghị ike ahụ, adịghị ike nke uche na ihe niile ndị ọzọ were ya tụnyere Atiku. Atiku ga-agbali mmaji abụọ karịa Buhari."" N'ofesi Onyeisiala mba Cannada bụ Justin Trudeau nabatara akwụkwọ ozi nke mmadụ otu narị na iri anọ ndị welitere isi na gọọmenti na ndị nkuzi mahadum na Canada dere igi kpọọ oku ka mba China tọghapụ ndị mba ha abụọ China ji eji maka ebube inyopu ala na mba China. N' egwuregwu, Otu Manchester City nwere ike Iregharị onye egwu ha bụ Tosin Adarabioyo, onye ha binyeburu otu egwu bọọlu West Brom. Oge ọ na-agbara ndị West Brom gbaturu nke mere ndị Man City ji chọọ izipụ ya ebe ọzọ." afirika-46414832,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46414832,EFCC: Nwụchie Alison-Madueke - Ọkaikpe,Akụkọ dị mkpa,"Nwụchie nu Alison-Madueke - Ọkaikpe Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyeela ụlọọrụ EFCC ikike ka ha nwụchie onye bụbu minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison-Madueke. Ọkaikpe Valentine Ashi chabiri ikpe a n'ihi ebubo dị ise eboro Diezani nke gụnyere inye onyinye n'ụzọ n'ezighi ezi. Atiku na Obi Amalite ọsọ achụnta vootu Onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar na osote ya bụ Peter Obi amalitela ịgba ọsọ achụm nta Vootu na Sokoto Steeti. N'ozi ha wepụtara n'akara twitter ndị PDP, ha kwuru na ntuliaka 2019 bụ maka ọdịnihu ụmụaka na ndị ntoroọbịa Naịjirịa. N'ofesi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mba China ka ewepụ ego dị pacenti iri anọ n'ụtụisi ụgbọala ha bugara na mba ahụ. Mana mba China ekwubeghi ma okwu a si n'akara twitter Trump ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị. N'egwuregwu Otu na-ahụ maka asọmpi Premier League eriela onye nchịkọta otu Liverpool bụ Jurgen Klopp iwu maka ịkpa agwa ọjọọ. Klopp ji ọsọ gbaba n'ime ọgbọ egwuregwu ga makọọ onye oche bọọlụ ya n'asọmpi dị n'etiti Liverpool na Everton. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ Taa bụ ụbọchị ncheta ndị nkwarụ Emume ụbọchị ncheta ndị nwere nkwarụ maọbụ ndị ike dị na obi amalitela n'uju na Anambra steeti ebe Ezenwaanyị steeti ahụ bụ Ebelechukwu Obiano mepegoro ya bụ emume nke aga eme izu ụka a niile. Onye nchikọta ndị otu a akpọrọ National Association of Persons Living with Disabilities bụ Comrade Ugochukwu Okeke kwuru na emume nke afọ a gbadoro ụkwụ na ịnabata ndị ike dị n'obi ka ọnụ na-eru ha n'okwu. Boko Haram egbuola ndị agha Naịjirịa abụọ Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndị ọlụọọla bụ Boko Haram egbuola ndị agha Naịjirịa mmadụ abụọ ọzọ na nwakpo ọhụrụ ha wakporo ndị agha na Yobe steeti. Nke a na-eme ka arụmarụ na-aga n'ihu maka otu ijeri naịra amapụtara maka ibu agha ndị omeketereihepụụjọ bụ nke ọchịagha Tukur Buratai sị na ọ ga-eru ha aka mgbe adịghị anya. Ọgbakọ mbaụwa mbaraeligwe na ụwa Ọgbakọ mbaụwa maka mbaraeligwe na ụwa na akpọtụ na Poland taa Ndị ọnụ na-eru n'okwu na ihe gbarasara ọnọdụ mbaraenikwe n'ụwa bekee kpọrọ Climate Change ekwuola na ụwa anyị nọ n'ime ya nọzị na agbata mmụọ na mmadụ. Ha kwuru nke na Poland bụ ebe nzụkọ ndị otu a na-akpọtụ bụ ebe ha nọ dọọ aka na ntị ka ebelete anwụrụ ọkụ ọjọọ iji zọpụta ụwa. Iko anyị buru ga-akpalite mmụọ anyị Oneme Ebi onyi otu n'ime ndí akpụobi ndị Super Falcons N'egwuruegwu, Ka ndị Super Falcons gbara ụkwụ na Abuja ụbọchị Satọde, nwada Onome Ebi otu ekwuola n'iko a ha butere ewulitela mmuo ha maka nkwado igba iko mba ụwa ụmụnwaanyị na afọ ọzọ. Na mmechi, ekpụghela amụma ibido Uefa Champions lig nke abụọ na 2021. Gọmenti ewezụgala iwu Onye rụọ orie Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Gọmenti etiti ewezugala iwu ọnye rụọ ọrie ha kwadoburu ịnye ndị Nkuzi mahadum nọ abụbụ ọrụ. Onye nchikọta ndị Academic Staff Union of Universities, ASUU bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi kwuputara nke mgbe ọ na-aza ndị nta akụkọ ajụjụ. Gee nkeji anyị ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa David Anyaele na-akpọku na ndị Igbo maka mbinye aka 2019 Akụkọ ga-amasi gị" afirika-44917604,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44917604,Akụkọ ndị dị mkpa: Ekweremadu chọrọ nhatanha na nkesa ọkwa gọọmentị,Akụkọ dị mkpa taa,"Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu Osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremmadu ekwuola na otu ụzọ a ga-esi kwalite udo n'ezi obibi na Naịjirịa bụ ịkekọrịta ọrụ, ọkwa dị ịcheiche nakwa ngalaba n'ụzọ dị nhatanha. O kwuru na atụmatụ a ga-ebute udọ karịa ịkwe naanị nkwa nkịtị. Ndị uweojii na Legọs anwụchiela mmadụ ise bụ ndị isi otu ndọrodọrọ PDP na Legọs maka ọnwụ otu n'ime ha. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legos kwuru na ọ bụ ọgụ na mgba mere na nzụkọ pati ahụ riri ndụ nwoke ahụ. N'Afrịka, Ụzụ akwa n'atụ na mba Sawụt Afrịka ebe ndị o ji egbe egbu wakporo ma gbuo mmadụ iri n'otu bụ ndị na-anya ụgbọala tagzi. Ndị uweojii na mba ahụ kwuru na a wakporo ha mgbe ha si akwamozu onye otu ha alọta ma kwuo na mmadụ anọ n'ime ha nọ n'ụlọọgwụ. N'Egwuregwu, Alex Iwobi bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa na-akwado ibinye aka n'ime akwụkwọ ọrụ ọhụrụ ga-eru afọ 2022 n'otu Arsenal. N'otu aka ahụ otu Leicester city ajụla ịtọghapụ Ahmed Musa ka o sonye n'otu Al Nasr nke Sawudi Arebịa. Gee nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa: Onyeoru Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọọs na-aga Owere" afirika-46121517,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46121517,Oke ọkụ latrik emebiela igwe okwu n'ụlọomeiwu nta,Akụkọ dị mkpa:,"Ndị ụlọomeiwu nta arụghị ọrụ taa makana igwe okwu ha a zụrụ kemgbe afọ 1999 arụghị ọrụ. Onyeisi ha bụ Yakubu Dogara kọwara na ọ bụ oke ọkụ latrik mebiri igwe okwu ahụ Ekweremadu ekweteghị na nchọpụta ndị uweojii Ndị gọvanọ sị mpaghara ọwụwa anyawụ ekwola na ha ekweghị n'ihe ndị uweojii kpebiri na ọ bụ ndị ohi wakporo be Ike Ekweremadu. Ekweramadu n'onwe ya sị na ọ ga-agbasa ihe nkiri gosiri oge ndị a batara be ya, ịji gosi na ndị a bụ ndị chọrọ igbu ya. Ụkọchukwu Obinna agbahariala Okorocha Ụkọchukwu Anthony Obinna bụ aka na-achị ndị ụka katolik n'Owere agwala BBC Igbo na onweghị esemokwu dị n'etiti ya na gọvanọ Rochas Okorocha. Obinna kọwara na ihe butere iwe bụ makana ya chọrọ ka ndị Imo nwee ọchịchị nke ga-amịpụta mkpụrụ. N'Afrika N'Afrika, ndị omekome atọhapula ndị ụmụakwụkwọ ahụ sị mba Cameroon ha tọrọ n'ụbọchị ole n'ole garaga. Akụkọ na-erute BBC ntị bụ na atọhapụrụ ha taa na nkiti. Jose Mourinho N'egwuregwu bọọlụ, otu FA ekwuola na ha ga-arịọ ka ha kpegharịa mkpebi kwuru na onweghị nha ha ga-ada Jose Mourinho maka okwu ọjọ o kwuru na ngwụcha asọmpị Man U na Newcastle gbara ụnyahụ. Mwakpo ụlọ Ike Ekweremadu Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata Ndị uweojii ekwuola na mwakpo mere n'ụlọ osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu bụ naanị maka izu ya ohi na ọ bụghị igbu ya na ezinaụlọ ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh Moshood kwuru na ahụrụ ngwaọrụ eji akpaka ụzọ n'aka onye anwụchiri mere nke a mana nyocha ka na-aga n'ihu. Uweojii kwuru na ndị mere nke a bụ onye akpọrọ Mohammed Yusuf si na Zamfara Steeti nọ n'aka ndị uweojii ugbua nakwa onye akpọrọ Ali gbara ọsọ. Yusuf wepụtara onwe ya kọwara ndịuweojii na ọ bụ ya na Ali so kpaa mkpakpa ahụ. NLC chọrọ iwu ụgwọ Opekatampe NLC bụ otu jikọtara ndị ọrụ niile na Naịjirịa Otu jịkọtara ndị ọrụ ekwuola na iwu ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ ga-adịnwu ire n'ime izuụka abụọ ma ọ bụrụ na onyeisiala zigara ya ndị ụlọomeiwu n'izuụka a. Onyeisi aha bụ Ayuba Wabba kwuru na ezi mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị ụlọomeiwu ga-eme ka nke a dị ire. N'Ofesi Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democrats ekpokọrọla ọkwa ọchịchị n'ụlọ nnọchite anya nke mba Amerịka n'ime ntuliaka ha mere. Ụdị mmerie a bụ nke ha na-enweta n'ime afọ asatọ ga-eme ka ha gbanwe ụfọdụ ebunobi onyeisiala bụ Donald Trump. N'egwuregwu Barcelona abụrụla otu bọọlụ mbụ ga-aba n'agba nke iri isii n'asọmpi Uefa Champions. Ebe Liverpool tara ọkpụ goolu abụọ n'aka Red Star Belgarde na asataghị otu, n'otu aka ahụ agbara Monaco ọkpụ goolu anọ chara acha. Ihe nkiri ndị ishi na-agụ egwu" afirika-47890943,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47890943,Arsenal vs Napoli: Onye ga-ata ikikere eze taa?,Akụkọ dị mkpa:,"Onye ga-ata ikikere eze maọbụ nọrọ n'ọṅụ mgbe Chelsea, Arsenal, Napoli na ndị ọzọ ga-agba asọmpi Europa League taa? End of Twitter post, 1 Azịza ajụjụ a dị ndị na-akwado ha n'obi ka ha na-echebiri ihe a ga-agbata. Chelsea ga-ezute Slavia Prague bụ ndị a na-atụ anya na ha ga-emeri, ebe Arsenal na Napoli ga-esukọta mpi. Ihe Naịjirịa chọrọ n'aka Sudan ugbua Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnụ n'ihe gbasara nchụpụ a chụpụrụ Onyeisiala mba Sudan bụ Omar-Al-Bashir n'oche ọchịchị. Onyeisiala Bashir wezụgara iwu ala ahụ nakụkụ n'ọnwa Februwarị Geoffrey Onyeama bụ minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ọzọ, gwara BBC na Naịjirịa na-atụ anya na ọgụ na mgba agaghị adapụta. O kwukwara na ha ga-achọ ka Sudan mee ngwangwa chịkọta onwe ha ọnụ dịka iwu obodo ha kwuru. Ụkwa dagidere Diego Costa Ị ma Diego Costa na-agbara Athletico Madrid bọọlụ? Amachiela ya iso gbaa bọọlụ n'egwuregwu asatọ maka mkparị ọ kparịrị ogbu opi ụbọchị ha na Barcelona zutere na La Liga. Ndị Uweojii akwala ndị otu ha teta n'ụra Ndí uweojii Naíjiría akwadola ílúsa ndí Omeketereihepúújó agha Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed A. Adamu agwala ndị otu ya bụ ndị riri mperi n'ọrụ ha gbaa mbọọ chegharịa ma chigharịa. Adamu kwuru nke a mgbe ọ nọ n'ọgbakọ ha kpọrọ maka ịtụpụta amụma ọhụrụ ga-enyere ha aka ịbaso ndị ekperima, ndị ntọ nakwa ndị ọmekataraihepụụjọ agha na Naịjirịa. Nwụchi Julian Assange Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị uweojii anwụchiela Julian Assange n'obodo London. Minista na-ahụ maka ndị ọbịa na ndị mbịarambịara na mba Briten bụ Sajid Javid gwara BBC na nke a bụ eziokwu. ""Ka ọ dị ugbua ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii"" ka Javid kwuru. Ndị omeiwu kwekọrịtara ịga n' ihu na iwu ga-agbanwe Iwu Naijiria nke afọ 1999 nke atụpụtara n' afọ 2018. Ha lebanyere kwara anya na iwu ga-akwalite mmmepụta ngwahịa (Industrial Development Amendement Bill) nke afọ 2018. Iji kụpụ ọjụjụ onyeisiala ibinye aka n'ibibụta iwu ọhụrụ, ụzọ abụọ na ime atọ, ya bụ mmadụ 73, ndị omeiwu ga-akwado ya. Na nkọwa ya, oge ọ na-ewepụta ozi nke kọmiti lebanyere anya na iwu ndị a, onyeisioche kọmiti ahụ bụ David Umaru kwuru na ha lebanyere anya n'ihe ndị onyeisiala rụtụrụaka mere o jighị kwado iwu ndị ahụ. N'okwu ya onyeisi Sineti bụ Bukọla Saraki kpọọ okụ na steeti ọbụla nwe ndị uweojii nke ha ji belata nsogbu chekwa dịka ọ gbalitere elu na Zamfara nakwa ebe ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị:" afirika-45125612,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45125612,Anwụchiela di na nwunye na-ere ụmụaka n'Imo,Akụkọ ndị dị mkpa,"Aka akparala otu di na nwunye n'Imo steeti maka orure ụmụaka gụnyere nwa ha nwoke. Ndị uweojii nwuchiri Ugochukwu Nwachukwu na nwunye rere nwa ha bụ Marvellous n'ime obodo Umueme Obike n'okpuruọchịchị Ngọr Ọkpala Onyeisioche otu ndị gọvanọ Naịjirịa bụ Abdulaziz Yari nke Zamfara steeti akatọla mmachi ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ EFCC tinyere n'akụnaụba Benue steeti. Ọ sị na atụmatụ a ga-etinye steeti ahụ n'ezigbo ahụhụ. EFCC kwuru na ọ bụ maka mpụ gọọmentị Benue na-eme ka ha ji machie ya bụ mmachi. N'akụkọ ofesi, Xi Jinping, onyeisiala China na Donald Trump, onyeisiala Amerịka Ego mmanụ agbịdị adatuola dịka mba China na mba Amerịka na-ama aka gbasara ọzụzụ n'orure ngwa ahịa ha. Mba China manyere pasentị iri abụọ n'ise n'elu ụgwọ ụtụ mba Amerịka ga-akwụ iji bubata ya bụ mmanụ na Chịna. N'egwuregwu, Kepa Arrizabalaga bụ bụ onye nche bọọlụ otu Athletic Bilbao ebinyela aka n'otu Chelsea dịka onye nche ọhụrụ ha. Cheta na Thibault Curtois cheburu Chelsea bọọlụ agafeela n'otu Real Madrid ugbua. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?" 45771541,https://www.bbc.com/igbo/45771541,Akụkọ dị mkpa: Enwe achụọla ọkwọ ụgbọala n'ọrụ,Ntụliaka imeụlọ PDP,"Na mba ofesi Prakash bu mmadụ 30 n'ụgbọala ya mgbe enwe nyatara ya A kwụsịla otu onye na-anya ụgbọala na mba India ọrụ ịkwọ ụgbọala makana o kwere ka enwe nyaa ụgbọala ya nke mmadụ ruru iri na atọ nọ n'ime ya. Ndị na-ere ihe gbasara Pati PDP Ntụliaka imeụlọ PDP Ka na-aga n'ihu ebe ndị otu Pati ahụ biara ịtụ vootu edenyechala aha n'akwụkwọ ma na-eche ka ntuliaka bido. Ihe karịrị mmadụ puku atọ ga-atụ vootu taa na ya bụ ọgbakọ ebe e nwere mmadụ iri na abụọ na-azọ oche onyeisiala n'etiti ha. Onye Igbo ga-anọchite ndị bi na Lagos Jude Idimogu nọbụ na pati PDP Onye Igbo azọtala ohere ị nọchite anya ndị bi n'Isolo /Mushin dị na Lagos steeti. Aha ya bụ Jude Emeka Idimogu. O si na PDP fee na pati APC. N'egwuregwu, Achụpụla Jose Mourinho n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England Ndị otu Man. Utd ekwuola na-asịrị na-agagharị na aga achụ onyeisi ha bụ Jose Mourinho n'ọrụ dịka okwu na-enweghị isi. Okwu a bidoro kamgbe otu Manchester United dachara na mbido egwuregwu agba ọhụrụ Premiere league. Gere akụkọ mere na mgbede a na nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?" afirika-46264485,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46264485,Ndị ụlọomeiwu Anambra steeti echeela ndị uweojii aka mgba,Akụkọ dị mkpa,"Ndị ụlọomeiwu anambra steeti agwaala ndị uweojii ka ha gbahie ụlọọrụ ha ha mechiri ka mgbe izuụka garaaga ka ha rụọ ọrụ ha. Cheta na nsogbu dara n'ụlọọrụ ahụ oge ụfọdụ n'ime ndị omeiwu steeti ahụ chuturu onyeisi ha bụ Rita Maduagwu, mana Maduagwu ka na-ekwu na ya bụ onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ. Atiku ekwela ndị Naịjirịa nkwa Atiku ekwuola na ọchịchị ya ga-abụ maka mmadụ niile nọ na Naijiria, na agbanyeghị mpaghara ha si. O kwuru nke a na Monde n'ime ozi ịchụ nta vootu maka 2019. N'ofesi N'ofesi, ndị uweojii anwụchiela Carlos Ghosn bụ onyeisi ụlọọrụ Nissan na-arụpụta ugbọala dị iche iche. Ha na-ebo ya ebubo mpu na aghụghọ. N'egwuregwu Onye ọgbabọọlụ otu Wolves bụ Jonny Otto agaghị eso n'asọmpị ọbụla ruo izu isii makana akwara dọwara ya. N'akụkọ yiri ibe ya, ndị uweojii na-ekwu na ha ka na-eleba anya n'ebubo nwakpo dị n'isi ọgba bọọlụ ama ama aha ya bụ Paul Gascoigne. Mana Gascoigne na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha. Gee nkeji abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'" afirika-49247435,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49247435,Toni Morrison: Ihe isii ị maghị maka nwaanyị a riterela nturuugo 'Nobel' maka edemede ya,Toni Morrison alaala mmuo,"Akụkọ ndị dị mkpa taa bụ Tuzde (6/8/2019) Akwụkwọ akụkọ Morrison dere gunyere 'The Bluest Eye', 'Beloved', 'Paradise' na 'Love' Toni Morrison, nwaanyị mba Amerịka a ma ama maka irite nzere 'Nobel Prize' n'ihi akwụkwọ o dere anwụọla ka ọ gbachara afọ 88. Morrison nwụrụ ka ọ rịchara ọrịa nwa oge dịka ndị ezinụlọ ya si kwuo. Ihe isii ị maghị maka Toni Morrison 1. Nwaanyị nne na nna ya abụghị ọgaranya mana ha gbara mbọ ziga ya ụlọakwụkwọ mahadum ebe ọ gụrụ maka asụsụ Bekee bụ onye na-ede akwụkwọ e jiri ide maka ịgba oke agbụrụ mara. 2. O dere akwụkwụọ agụmagụ ruru 11 ndị gụnyere 'Beloved', 'Paradise 'Love ' nakwa 'The Bluest Eye' nke bụ akwụkwọ mbụ o dere n'afọ 1970. 3. Akwụkwọ ya bụ ""Beloved"" bụ akụkọ maka nwata nwaanyị ohu gbara ọsọ, nke mechara bụrụ ihe e tinyere n'ihe onyonyo nke agbara nwaanyị a ma ama bụ Oprah Winfrey soro mee. Obama tunyere ya nzere 'Presidential Medal of Freedom' 4. 'Beloved ritekwara Morrison nzere 'Pultizer.' 5 N'afọ 1993, e tunyere Morrison ugo nke 'Nobel Prize for Literature' nke mere ya nwaanyị isiojii mbụ ga-enweta nturuugo ahụ. 6. Nzere ndị ọzọ Morrison ritere gụnyere ;'Légion d'Honneur' nakwa 'Presidential Medal of Freedom' nke ọbama tunyere ya n'afọ 2012. EFFC ekechiela akpaego Legọs steeti dị n'ụlọakụ atọ AkinwunmiAmbode bụ aka chịburu Legọs steeti Ụlọikpe ukwu dị n'Ikoyi Legọs nọrọ ụbọchị Tuzde nye iwu ka a kpachie akpaego atọ nke bụ nke Legọs steeti maka mmefu ego ruru ijeri naira itoolu na ụma (N9.9billion). Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka a kpọrọ EFCC n'aha ịchafụ kpara akwụkwọ were rịọ ikike ijichi akpaego ndị ahụ nke odeakwụkwọ Akinwunmi Ambode oge ọ bụ aka na-achị Legọs steeti bụ Adewale Adesanya ma maka ya. EFCC ndị gbara ama n'akara Facebook nakwa Instagram ha na-ebu ebubo na ego karịị ijeri naira itoolu sị n'akpa Legọs steeti banye n'akpaego dị n'ụlọakụ atọ( anyị achọghị ịkpọ aha ha) n'oge ọchịchị Ambode nke Adesanya na ndị ọzọ ga na-adobiri. Emume Sala eruola Eid el Kabir bụ emume ndị ụka Alakụba ji Ebule eme. Gọọmentị etiti ekwuputala na ụbọchị Monde nakwa Tuuzde, abalị iri na abụọ na abalị iri na atọ nke ọnwa Ọgọst, ga-abụ ụbọchị ezumike ọha obodo. Nke a bụ iji sonyere ndị okpukpere alakụba na mmemme ""Eid el Kabir"" nke afọ a. Onyeisi ngalaba mgbasaozi na mịnịstrị 'internal affairs' bụ Mohammed Manga, kwuputara nke a n'akwukwọ akụkọ o zipụrụ na mgbede taa bụ Tuuzde. Wayne Rooney alọghachila England N'egwuregwu, onye bọọlụ a ma ama bụ Wayne Rooney ahapụla otu egwuregwu bọọlụ DC United nke mba Amerịka laghachi England wee sonyere ndị otu Derby County. Rooney ga-arụ ọrụ na Derby County dịka ọgbaa bọọlụ nakwa onye nkuzi bọọlụ iji were na-akwado maka ibido ndụ dịka onye nkụzi bọọlụ mgbe ọ ga-akwụsị ịgba agba. Unu emeela n'ịgbajọ 'RevolutionNow' - Onyeisiala Buhari Ụlọọrụ onyeisiala ekeleela ndị Naịjirịa maka apụtaghị ịbịa soro mee ngagharịiwe 'Revolution Now' ụbọchị Ọgọst 5,2019 dịka ọtụtụ ndị gawara mkpa dịịrị ya. Onye enyemaka onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu kwuru na nke a bụ mmeri nye ọchịchị onye-kwuo-uche-ya. N'okwu ya, ""Taa ọtụtụ ndị Naịjirịa gawara mkpa dịịrị ha; ọrụ, ụlọakwụkwọ na ilekọta ezinaụlọ ha, site n'ime nke a ha chekwara ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke Naịjirịa tara ahụhụ nwete."" Shehu gara n'ihu kwuo na ndị so mee ngagharịiwe a mere ya maka ọchịchọ nke onwe ha. Enugwu Steeti ga-ehiwe ndị nchekwa oke ọhịa Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ha ga-ehiwe ndị nchekwa oke ọhịa dị mmadụ otu puku na narị asaa n'ime otu ọnwa iji kee nkwụcha n'ihe banyere nchekwa. Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kwuru nke a na nzuko ya na ndị nchekwa ime obodo nwere n'ụbọchị Mọnde. N'Ofesi Ụlọọrụ akụnaụba nke mba Amerịka a kpọọla mba Chaịna ndị mwụgharị ego dịka ọnụ ego Yuan nke Chaịna dara na ntụnyere dọla nke Amerịka Okwu a nwere ike ibute obimgbalielu n'azụmaahịa dị n'etiti mba abụọ ndị a. N'egwuregwu Onye bụbu onye nchịkọta otu egwuregwu Mountain of Fire bụ Fidelis Ilechukwu etinyela aka n'akwụkwọ ịchịkọta ndị Heartland nke Owere rue afọ atọ. Ilechukwu bụ onye a na-akpọ 'the working one' na-agba mbọ ịchọpụta ụmụaka nwere onyinye ịgba bọọlụ na Naịjirịa. . Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-44449831,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44449831,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Kim ezutela na Singapore,Akụkọ kachasị mere taa;,"Humphrey Nwosu agaghị azanwu Buhari Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka nke afọ 1993 nke họpụtara MKO Abiola dịka onyeisiala, ekwuola na ọ gaghị azanwu oku gọọmentị kpọrọ ya maka ikwanyere Abiola na ndị ọzọ ugwu. Nwosu kelere gọọmentị maka nkwanye ugwu a, ma kwuo na ya agaghị abịanwu emume nke e hibere taa, maka na ọ nọ na mba ofesi. Peter Obi etoola Buhari Peter Obi bụ onye chịburu Anambra steeti etoola Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ime ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya. Obi kwuru na ọ bụ ohere iji mezie ihe ndị mebirila na Naịjirịa nakwa imezi ihe na ndụ ndị ọzọ Juun 12 a metụtara dịka Humphrey Nwosu, Ralph Obioha nakwa Dan Suleiman. Akụkọ mba ofesi; Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ Onye isiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nke Nọt Koria bụ Kim Jong-Un ezutela ma kelee onwe ha na Singapore. N'ime nzukọ a, ha binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, ebe Kim kwuru na ha ekpebiela ịhapụ ihe ndị mere n'oge gara aga. N'egwuruegwu, Ndị otu Super Falcons wụrụ ndị Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii asataghị otu ka ha na zutere na Lagọs maka ịmata onye ga-etozu isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Desire Oparanozie nyere ọkpụ goolu anọ, ebe Asisat Oshoala nyere abụọ. Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Ihe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala" afirika-46082476,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46082476,Orji Uzọr Kalu : Akwụ m chịm onweghi ihe na-eme,Akụkọ dị mkpa,"Aka kwụ m chịm - OUK Ndị otimkpu aka chịburu Abia Steeti bụ Ọrji Uzor Kalu ekwuola na ahụ dị ya chịmchịm ugbua dịka ọ gwachara ha okwu n'ekwenti n'oge adịghị anya. Cheta na akụkọ kwuru na nwa amadị mere njem na mba Jamini bụ ebe ọ gara ịwa ahụ n'ihi ọrịa a na-akpọghị aha ya. Oko osisi ọ daala n'ụlọ Ojukwu? Ụmụnne Ojukwu na nwunye ya gara ụlọikpe maka akụnaụba nna ha Akụkọ ọzọ na-eru anyị ntị bụ na Sylvester Dede Ojukwu bụ ọkpara dike Biafra bụ Odumegwu Ojukwu anwụọla n'abalị ụnyaahụ. BBC Igbo kpọtụrụ nwanne ya nwoke bụ Emeka Ojukwu, okwughi ma ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị kama o kwuru na ọ chọghị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu. Abụbọrụ agaghị egbochi mkparịta ụka anyị - Ngige Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na mkparịta ime udo n'etiti gọọmentị na ndị ọrụ ga aga n'ihu echi agbanyeghi abụbụ ọrụ nke ndị ọrụ na-esi ọnwụ ime. Ngige rọrọ arịrịọ ka ndị niile nke gbasara gbalịa bịa nzukọ ahụ maka i ji gbo nsogbu ọgwụ opekatampe ndị ọrụ. Anya anyị ga-acha ọbara n'ụbọchị Nov 6 - NLC Na mba Afrịka ọzọ Akwa dara na mba Ijipt dịka ndị mmadụ gbakọtara ili ndị ụka kraịst asa a gbagburu n'ebe ha gara ikpe ekpere na njem ala nsọ ha mere. Ndị agha nnupuisi Islamic State kwuru na aka ha dị n'ọnwụ mmadụ asa ndị a. N'egwuregwu Manchester United lara na nta dịka ha si na-azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ndị AFC Bournemouth n'asọmpi Iko Premier. N'aka nke ọzọ, anya niile na-ele ka eke ga-esi anya anwụ n'asọmpi ga-adị n'etiti Arsenal na Liverpool n'abalịa. Nkeji abalị Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Leekwa ihe nkiri otu nwoke a sị daa mmiri na Legos Nwoke wụbanyere n'akwa mmiri 3rd Mainland Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ Gọvanọ Imo steeti na Adams Oshiomhole onyi isi pati APC Oshomhole akụwaala akị oyibo nsugbe n'isi Okorocha Ibe anyịnụ, pati APC akụwala akị oyibo nsugbe site na inye INEC aha Hope uzodimma dịka onye ga-ebutere pati ha ọkọrọtọ na ndọrọndọrọ ọchịchị gọvanọ Imo Steeti 2019. Adams Oshiomhole bụ onyeisi APC kwuputara nke a ụbọchị Fraịde bụ ebe ọ nọ kwuo na ihe ya mere bụ ihe ụlọikpe ukwu kwuru. Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha Mana akụkọ a na-anụzi ugbua bụ na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja egbochiela Oshiomole na kọmitee ọrụ nke APC i ziga aha ọbụla na-abụghị aha Uche Nwosu nye ndị INEC. Ụlọikpe gakwara n'ihu nye ndị INEC iwu ka ha ghara ịna-abata aha ọbụla na abụghị aha Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti. Ndị ụka Anglican etie kpaa n'Anambra steet Ndị ụka Anglican chọrọ ka e nyeghachi ha ụlọakwụkwọ ha Anyị agaghị ekwe o, Anyị agaghị ekwe! Ndị ụka Anglikan bụrụ ngagharị iwe ụbọchị frịade bụgara gọvanọ Anambra steeti bụ willie Obiano na ebo ya ebubo na ọ were ụlọakwụkwọ ha bụ Bishop Crowther Primary School nyefee ndị katọlik na'aka. N'ofesi onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey. Chioma:Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey. Recep Erdogan Onyeisiala Turkey N'ofesi, onyeisiala mba Turkey bụ Recep Erdogan akachiela obi tụọ mba Saudi Arabia aka dị ka ndị gburu Jamal Khashoggi bụ onye nwuru na Turkey. Nchọpụta ndị Turkey mere na-egosi na atọgbụrụ ya bụ nwaamadị bụ onye nọ na ọsọ ndụ ka ọ gara iwete akwụkwọ ikike maka agbam akwụkwụọ nwunye ya n'obi nnọchite anya mba ha na Turkey. N'egwuregwu Kepukepu maka Supa Lig adawala N'egwuruegwu, kepukepu na-eru anyị ntị na-akọ na ndị otu egwu bọọlụ nwere agba na Europe na-agba izu ka ha ga-esi mailte asọmpị ọzọ akpọrọ Super League n'afọ 2021. Ka ọ dị ugbua onwebeghị ọnye kwere iti aka n'ala na nke a bụ eziokwu bụ ama a akwụkwọ akụkọ Der Speigel gbara. Gee Nkeji ụtụtụ ebe a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ndị a ga-amasị ịgụ tata" afirika-48457615,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48457615,A tụnyela Philomina Chieshe sị na agwọ loro nde naira 35 Jamb ụlọmkpọrọ,Akụkọ dị mkpa taa:,"A tunyela nwaanyị sị na agwọ lolo nde 3.5 Jamb ụlọmkpọrọ Ụlọikpe n'Abuja atụnyela Philomina Chieshe, nwaanyị kwuru na agwọ loro nde naira Iri atọ na ise ego Jamb etinyere ya n'aka na mmadụ ise ndị ọzọ n'ụlọmkporo ganyere mgbe ikpe ahụ ga-ebi. Chieshe sị na agwọ loro nde naira iri atọ na ise ga-azara ọnụ ya n'ihu ọkaikpe. Ndị EFCC na-eme nyocha banyere mpụ dị na Jamb EFCC kpụpụrụ Philomina Chieshe ụlọikpe ka ọ ga kwuo etu ya na mmadụ ise ọzọ na agwọ jiri mee ego ha retara ngalaba na-ahụ maka ule mahadum bụ Jamb. Biafra Remembrance : Ndị e chere bụ Ndị Ipob tiri Fada ihe Ndị e chere na ha bụ ndị Ipob kpuru otu ụkachukwu Katolik a kpọrọ Fada Festus Ezeamaka bụ ụkọchukwu na-edu ụka katọlịk nke Saint Jude dị na Nnewi isi aba okpu ụbọchị Tozde. Fada gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị ntoroọbịa na-amanye ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị Mee 30 nke 2019 wakporo ya ka ọ na-aga ịka 'Mass' ụtụtụ ụbọchị ihe mere. ""Ha jụrụ ma m che na ha na-egwu egwu mgbe ha si ka ndị mmadụ apụtaghị."" A 'gbabuọla' onye ruburu Kagame ọrụ Ndị na anọghị n'ọchịchị na mba Rwanda na-ekwu na agbauola Camir Nkurunziza bụ onye ruburu Onyeisial mba ahụ bụ Kagame ọrụ maburukwa onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye na mba Saut Africa ebe ọ gbagara ọsọ ndụ mana ndị uweojii Saut-Africa kwuru na ha ka na-enyo ebubo ahụ. ______________________________________________________________________________ Liverpool VS Tottenham: Ronaldo aghọla onye amụma? Ronaldo Da Lima gbaburu Brazil bọọlụ ebuola amụma na Liverpool ga-emeri Tottenham n' asompi ha-ga-agba ụbọchị Saturday. Gee akụkọ ndị a nebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akpụrụakpụ Akachi ka ọ dị taa bụ Wenezde Aka m adịghị n'ikutu Akachi - Ihedioha Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Emeka Ihedioha agọọla na aka ya adịghị na nkụrịkpọ emere na akpụrakpụ Akachi dị n'Owere. Agbanyeghi na a na-arụ aka na-ebe gọọmentị ya, Ihedioha kwuru na ndị Imo ahụghị ha bụ akpụrakpụ n'anya ma ga n'ihu katọ ya bụ akpụrakpụ. Ndị amabeghị onye ha bụ gara ikutu Akpụrakpụ ahụ ụnyaahụ. N'Ofesi Mba Congo anabatala ozu Etienne Tshisekedi ka omechara afọ abụọ ọ nwụrụ. Tshisekedi bụbụ onyeisi party na-anọghị na gọọmentị nwụrụ na mba Belgium mana gọọmentị Laurent Kabila machiri ịbụlata ozu ya. Nwa ya Felix Tshisekedi, bụzị aka na-achị Congo ugbua Ndị egwu Flying Eagle gbara ọnyụba n'asompi ha na mba Ukraine N'Egwuregwu, Flying Eagles nke Naịjirịa agafela agba nke abụọ n'asọmpị akpọrọ Fifa Under 20 World Cup na Bekee. Flying Eagles ritere erere ịgafe mgbe ha na Ukraine ọkpụ ọkpụ sị onwe ya onye laba onye laba mgbe ha zutere ụnyaahụ. Gee nkeji a n'uju ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" media-45697181,https://www.bbc.com/igbo/media-45697181,Akụkọ dị mkpa: NLC agwala ndị ọrụ ha laghachị n'ọrụ,Akụkọ dị mkpa taa:,"NLC akpọbiela abụbụ ọrụ Ndịọrụ chọrọ ụgwọọrụ opekatampe ọhụrụ Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua ekwuola na otu jikọtara ndị ọrụ Bekee niile a kpọrọ Nigerian Labour Congress akwụsịla abụbụ ọrụ nke ha kpọkọrọ n'izuụka gara aga. Onyeisi NLC bụ Denja Yaqub kwuputara nke a n'ozi ha gụpụtaara ndị ntaakụkọ n'Abụja taa. Gụọ maka abụbụ ọrụ ahụ ebe a: NLC: Ka abụbụ ọrụ sịrị kwụrụ n'alaigbo PDP Enugwu ahọpụtala Ifeanyị Ugwuanyi PDP Enugwu ahọpụtala Ugwuanyị maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 PDP Enugwu steeti akwadola Ifeanyi Ugwuanyi dịka onye na-eburu ha ọkọrọtọ na ndọrọndọrọ gọvanọ steeti ahụ na 2019. N'otu aka ahụ, APC Abịa steeti ekwekọrịtala ka Onyeisiala Muhammadu Buhari pụta maka ịzọ ọchịchị onyeisiala 2019. Theresa May sị nauche ya dị na Brexit May: Gọọmentị anyi kwesịrị ime otụtụ ihe Aka na-achị mba Britain bụ Theresa May ekwusiela ike na obi siri ya ike na ya ga-ahazinwu nnwereonwe Britain a kpọrọ 'Brexit' na Bekee. May kwuru nke a n'ịsa okwụ ndị sị na ọ maghị ihe ọ na-eme gbasara etu azụmahịa mba Britain na ndị EU ndị ọzọ ga-adị mgbe ha kewara. Cristino Ronaldo nwere ike ịtụmmadụ mkpọrọ Cristiano Ronaldo agwala ụmụ ụwa aṅalantị n'ebubo otu nwagbọghọ na-ebo na ọ kwasoro ya iko n'ike n'afọ 2009. Ọkaiwu Ronaldo ekwukwaala na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ndị Jamani bụ Der Spiegel bụ ndị buru ya bụ akụkọ ụgha, ụlọikpe. PDP eyigharịala ntuliaka imeụlọ ụfọdụ steetị. N'akukọ yiri ibe ya, otu ndọrọndọrọ APC ekwuola na eyigharịala ụbọchị ha ga-eme ntuliaka nke ime ụlọ na PDP nke Imo, Lagos na Kano steeti mana ha ekwubeghị ụbọchị ha ga-eme yabụ ntuliaka. USAID adoola aka na ntị maka ihe nwere ike imebi ntuliaka Naịjirịa na 2019 Otu sị mba ofesi na-elebanya na nkwadebe ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2019 na-ekwusike na egwu na-atụ ha gbasara nkwadeba ntuliaka a. Ha kwuru na ọtụtụ ihe dị iche dịka nsogbu ndị omekome, orire vootu nakwa ozi asị na social media nwere ike imebi ntuliaka a na 2019. Akwa adaala n'Indonisia N'ofesi, ala mara jijiji egbuola mmadụ karirị narị anọ n'asatọ n'ala Indonisia. Ndị gbatagbata kwuru na ha ka na-achọ ndị dị ndụ n'ebe a ihe a mere. Jose Mourinho ọ ga-achịkọta Man U n'ihu? N'egwuregwu, Rio Ferdinand bụbụ onye ọgba bọọlụ otu Manchester United ekwuola na oge eruola ndị na-achị otu bọọlụ Manchester United lebe anya ma Jose Mourinho ga-abụ onye nchịkọta otu a ma ha na-aga n'ihu. O kwuru nke a maka ọkpụ atọ asatara otu West Ham jiri meri ha ụnyahụ mana onweghị ihe Man U na-ekwu ugbua maka okwu a. Gee nkeji nke ụtụtụ a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya" afirika-44649859,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44649859,Akụkọ kachasị n'abalị a: Amnesty International arụọla gọọmentị Naịjirịa aka ọjọọ,Akụkọ kachasị mkpa;,Otu Amnesty International ebola gọọmentị Naịjirịa ebubo Otu na-ahụ maka ugwu ruru onye bụ Amnesty International ebola gọọmenti Naịjirịa ebubo ịkwado ogbugbu ndị mmadụ bụ nke na-arị ibe ya elu ugbua na-ejideghị ndị ogbu mmadụ ahụ. Otu a kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị egburula n'afọ 2018 akarịala nke ndị nke e gburu n'afọ 2017. Ndị mkpọrọ n'Enugwu abaala ụlọakwụkwọ mahadum Mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ Enugu abaala ụlọakwụkwọ National Open Universịty nke Naịjirịa. Onye nchịkọta ụlọakwụkwọ a n'Enugwu bụ ọkanmụta Uche Onyia gwara ndị a na ụlọọrụ na-ahụ maka Mahadum enyela ha ikike ịgụ akwụkwọ. Agbagbuola onye ji aha pati Accord zọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti Ndị oji egbe agbagbuola onye jibu aha Accord Parti zọọ ọkwa Gọvanọ n'Akwa Ibom Steeti bụ Okon Iyanam n'ụlọ oriri ọhụrụ ya dị n'Ogun Steeti ụnyaahụ. Iyanam zọrọ ọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti n'afọ 2015 n'aha Pati Accord. Egwuregwu: Mba Senegal esorola ogbo ha ndị mba Afrịka ndị ọzọ kwakọrọ pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke pụtara na onweghị mba Afrịka ọbụla fọrọ n'asọmpi a. N'abalị a Jaapan ga-ezute Tunisịa ebe Ịngland ga-ezute Beljọm. Nkeji nke abalị a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Ụmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ afirika-48810290,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48810290,Ruga Settlement esoghi n'ihe ngalaba m na-elekọta hibere - Yemi Osibanjo,Akụkọ nke ụtụtụ a,"Osinbajo si na ọbụghị ya ahazị n'atụmatụ Ruga Osote onyeisiala Naịjirịa Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọbụghị ya na-elekọta atụmatụ Ruga settlement ehibere maka ndị ochịehi. Ọnụ na-ekwuru ya bụ Laolu Akande kọwara na Ruga di iche na nke a kpọrọ 'National Livestock Transformation Plan' bụ nke Osinbajo na-ahazị. Ọkaikpe enyela EFCC ikike inye gọọmentị nde naira 49 na hụrụ na Kaduna Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ EFCC enwetala ikike iweghachiri gọọmenti Nigeria ego di nde naira iri anọ na itoolu bụ nke ha nwụchiri na ogige ụgbọelu dị na Kaduna n'ọnwa March 2017. Ọkaikpe Lawal Shuaibu nyere ikike ka eweghachiri gọọmenti Nigeria ego ahụ dika ọchụpụchara mmadu ole ma ole bịara kwuo na ọ bụ ego ha. N'ofesi, Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ Onyeisiala America bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-amasi ya izute onyeisiala North Korea bụ Kim Jong Un mgbe ọ ga-aga mba South Korea na ọdị nso a. Ndị North Korea sara sị na atumatụ ahụ ga-amasikwa ha mana ha anatabeghi ozi ọbula si n'aka Trump. N'egwuregwu, Ndị Egwuregwu Moroko na-enwe aṅụrị Moroco agafeela n'agba nke abụọ AFCON dika ha ji otu ọkpu goolu asataghị asata merie Ivory Coast ụnyaahu, Saụt Afịrịka ji otu ọkpụ goolu merie Namibia, ebe Tunishia na Mali gbara onwe ha onye lawa onye lawa. Ụmụnwanyị Amerịka jikwa ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee merie Frans iji gafee n'agba semi-final nke iko mba uwa nke umunwanyi ụnyaahu. Gee nkeji ndị ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị nke taata: Alex Ekubo Zangwa ngwa" afirika-46930645,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46930645,Atiku: Abuja kporo ọkụ dịka Atiku lọtara njem Amerịka,Akuko dị mkpa:,"Ndị otu PDP na ndị ihe Atiku Abubakar na-amasị pụtara n'igwe n'ọdọgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja iji nabata Abubakar, onye gara mba Amerịka. Atiku na onyeisi Ụlọomeiwu Naijiria bụ Bukola Saraki soro mee njem abalị abụọ na mba ahụ ebe dịka Atiku siri kọwa, ya ndị ọrụ gọọmenti mba ahụ na ndị ojiegoachụego nwere ọgbakọ. Atiku ga-esonye na ndọrịtaụka nke ndị na-azọkwa onyeisiala ga-eme n'abalị Satode n'Abuja. End of Twitter post, 1 Ọkụ gbara n'ụlọọrụ mmepụta mmanya Guinness Ọkụ gbara ụlọ mmepụta mmanya nke ụlọọrụ Guinness n'Osisioma Industrial Layout, Aba, Abia steeti ụbọchị Fraide. Ọkụ ahụ nke gbara rue awa isii bụ ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ, nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ nọ nso, ndị uweojii na ndị obodo ahụ nyere aka gbanyụọ ya. Ọnụ na-ekwuru Guiness bụ Nike Ọnakoya gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ emerụghị mmadụ ahụ nke ọ na emebei nnukwu ihe. O kwukwara na ọrụ mmepụta mmanya ha ka dị ire n' ọdọ ha dị na Benin nakwa Ogba,Lagos Breweries. ""O nweghị ihe mmerụ ahụ maọbụ nnukwu ihe mebiri site n'ihe mere dịka ọgba nke Aba bụ maka mgbarị ọrụ ma nwekwa naanị ndị ọrụ mmadụ ole na ole. Ebe anyị jiri mere ebe mmepụta manya bụkarịrị na ọdọ anyị dị na Benini nakwa Ogba(Legọs)."" Ọ bụ akụkọ ụgha na a chọrọ inwụchi Onnoghen Femi Adesina bụ onye ntaakụkọ ama ama tupu ọrụwa n'ụlọọrụ onyeisiala Ụlọọrụ onyeisala agọọla sị na akụkọ na gọọmentị chọrọ ịnwụchi ọkaikpe ukwu Naijiria bụ Jọstis Onnoghen bụ akụkọ ụgha. Ọnụ na-ekwuru onyeisisala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina kwupụtara n'igwe okwu Facebook ya na "" akụkọ ụgha"" ahụ nke ha boro otu jikọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị (Coalition of United Political Parties(CUPP) . Donald Trump: Ọganihu adịla n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa Nọt Korịa Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na enwela ọganihu were anya n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa mba Nọt Korịa. O kwu ya dị iche n'ihe ndị ọkachara na-ekwu sị na agabeghị ya ụzọ aga fọdụkwa iru ebe a na-aga. Liverpool na Crystal Palace chịpụrụ ya N'egwuregwu, Liverpool gbara Crystal Palace ọkpụ atọ asatara abụọ n'Asompi premier league ha mere ụbọchị Satọde. Gọọmentị ga-ere akụnaụba ndị aka ha dị na mpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na gọọmentị ya ga-ere akunaụba anatara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka ha dị na mpụ na nrụrụ aka. Buhari kwuru nke a na Kaduna bụ ebe ọgara achụmata vootu ụnyaahụ. Ọ sị na atumatụ bụ maka na ya achọghị ka eme ihe ọ sị na emere na afọ 1985, bu enyeghachi ndị a akunaụba ha. Ndị ụlọọrụ Ọkwaiwu ukwu Naịjirịa amalitela njem ịchụtụ Onnoghen Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Gọọmentị etiti agaala ụlọikpe Code of Conduct ịrịọ ka ewepụ Ọkaikpe Walter Onnoghen n'ọkwa ya dika Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ ikpe bu National Judicial Council. Onye eji aha ha tinye ya bu akwukwọ na CCT bụ Ọkaiwu ukwu Naịjirịa Abubakar Malami N'ofesi, Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na mba Mexico ka ọkụ bara igwe na-ebu mmanụ ụgbọala. Ọtutụ ndi ọzọ merụrụ ahụ na ihe mberede a mere na Hidalgo steeti dị na etiti Mexico. N'egwuregwu Mgbe Lobi Stars and Heartland FC zutere Lobi Stars nke Naịjirịa ga-ezute Asec Mimosas nke Ivory Coast taa n'isi obodo mba ahụ bụ Abidjan na agba nke abụọ ha n'iko CAF Champions League. Ndi Lobi ji okpu goolu abuọ asatara otu merie agba nke mbu ha na Mamolodi Sundowns gbara n'Enugwu. Gee nkeji ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa: ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC" afirika-49290190,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49290190,N30 million bounty: Ndị agha anwụchiela Bobrisky,Akụkọ dị mkpa:,"Ndị agha anwụchiela Bobrisky Aka ndị agha NAijria akarala Bobrisky na Rịvas steeti. Nke a na-eme na erụghị otu abalị Gọvanọ Nyesom Wike bụ aka na-achị Rivas steeti nyechara ntụziaka inye onye ọbụla gbara ama etu aga esi nweta Bobrisky nde naira 30. Ọ bụ Wike gbara ama na a nwụchiri Bobrisky na nzụkọ ya na ndị ndu obodo Rumuolumeni na obi gọọmentị na Pọtakọt. Bobrisky Gokana bụ otu onye otu nzuzo na-akpa ike nke a na-eno na aka ya dị n'ogbugbu otu onye ọrụ gọọmenti welitere isi na obodo Choba dị na steeti ahụ. N'otu aka ahụ, Idris Okuneye nke a ma ama dịka Bobrisky ekwuola n'akara Ịnstagram ya na ọ bụghị ya bụ onye omekome gọvanọ Rịvas na-achọ ka a nwụchie. "" Ekele dịrị Chukwu na abụzị m nwaanyị."" Ahụrụ achụsala ndị omeiwu Onyeisi ụlọomeiwu nyere ntuziaka ka agba ikuku isi ọma Ndọrịtaụka maka ịhe gbasara ọdọ ahịa bụ ihe gbosara n'ike n'ụlọomeiwu mba Kenya dịka isi ahụrụ kpọrụrụ na nsonso. Otu onye omeiwu bụ Julius Gaya sịrị, ""Onyeisi ụlọomeiwu, otu onye n'ime anyị anyụọla ahụrụ isi gbarụọ ikuku. Ama m onye mere ya."" Mana onye ọ tụrụ aka gọrọ isi onwe ya sị, "" Ọ bụghịkwa m. Agaghị emeli ụdị ihe n'ebe ndị ogbo m nọ."" Onyeisi ụlọomeiwu bụ Edwin Kakach nyere ntụzịaka ha agbasa ọgbakọ ha nwoke ka ihe na-esi kwụsịlata may nye iwu ka agba ikuku isi ọma n'ụlọomeiwu ahụ. Kwụọ nde naịra Ụlọikpe dị na Legọs enyeela onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Maurice iwu ikike iji ego dị otu ijeri naịra na ndị akaebe abụọ gbapụta onwe ya. Ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Iwu n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde n'ihi nrụrụaka ego dị otu ijeri naịra na ọma abụọ. N'akụkọ yiri ibe ya; Ụlọọrụ EFCC ekwuola na ha adịla njikere ịkpụpụ ọkaiwu Atiku Abubakar na nwanne ya nwoke n'ụlọikpe mpupu ego dị nde dọla abụọ. Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Tony Orilade gwara BBC Igbo na ndị a ga-awụchi n'ụlọikpe na-egbughi bịa zara ọnụ. Onyeisiala Buahri alala Daura O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Buhari alala n'obodo ya bụ Daura, Katsina Steeti maka emume Salah ga-amalite ụbọchị ụka ebe nwunye ya bụ Aisha gawara Mina, Saudi Arabia ime nke ya. Buhari na-anọ n'obodo ya rue abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ. N'ofesi Akụnaụba mba UK adaala mba nke mbụ ya kamgbe afọ 2012 dịka ụlọọrụ ngụkọ a kpọrọ National Statistics si kwuo. Ugwuanyị kwuru na O gaghị anabata enweghi nchekwa n'Enugwu Steeti Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka ndị eze ọdinala niile na ebighị na obodo ha n'Enugwu steeti were ọsọ laghachị azụ ga biri na obodo ha. Gọvanọ Ugwuanyi kwuru nke a dịka ya na ndị eze nwere nzụko n'ụbochị Tụzde. Ugwuanyị kwuru na nchekwa ndụ na akụnụba ndị Enugwu steeti kacha mkpa nke mere na ndị eze ọdịnala kwesịri ibi n'obodo ha na-achi ka ha nyere aka na nchekwa obodo ha. Ọnwụ Mazị Chimaobi Uzoukwa: ""Anyị ga achụ ikpe a churuo ya n'isi"" Gọvanọ Ikpeazu Gọvanọ Okezie Ikpeazu ekwuola na ọ ga ahụ na ekpere ikpe a otu okwesịri ekwesị Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na anwụchịela onye agha gbagburu nwaokoroọbia n'Aba. Obị adighị Ikpeazu nma dịka o kwuru na ndị nchekwa a na akwu ugwọ maka nchekwa ndi obodo bụzi ndi na-egbu ndi obodo ha na-echekwa. Ikpeazu kwuru nke a mgbe ọ gara mgbaru na be nwaamadị a nwụrụ sị na ndị Abia steeti anabataghị ụdiri agwa ọjuọ a ma kwee nkwa na ezinaụlọ ya agaghị ata ahụhụ. Na Kogi, Otu ndọrọndorọ ochịchị agbaala osote Gọvanọ bụ Simon Achuba arụkwaghịm. Ha kwụrụ na ha chụpụru ya nihi na okpara agwa megidere ọdịnma APC mgbe a na eme ntuliaka 2019. N'Ofesi, Onyeisiala Amerịka Donald Trump Ngalaba na-ahụ maka nnabata ndị mmadụ n'ọbodo Amerịka ekwuola na ha ahapula mmadụ nari atọ n'ime ihe ruru ndị mmadụ Nari isii na iri asatọ ha nwuchiri n'obodo Missisipi . Nwụchịkọ ndị a sọ na atụmatụ Onyeisiala Donald Trump weputara n'onwa Jụn maka ịnwụchị ndị na-ejighi akwukwo ziri ezi bata Amerika. N'Egwuregwu Alex Iwobi bụzị onye Everton Obi adighi ndị na akwado otu egwu bọolụ Arsenal mma dịka ha resiri Everton Alex Iwobi n'ọnụ ego ga eru Pounds iri atọ na anọ. Cheta na Iwobi bidoro gbawa Arsena bọolụ n'afọ 2015 ma ugbua, ọ ga a nonyere Theo walcot sikwa Arsenal gaa Everton. Gee nkeji BBC ebe: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee Akuko ga-amasi gị Lee Ihe Nkiri Ga-Amasị gị Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" afirika-45360383,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45360383,Ị hụla obodo kacha mma ibi n'ụwa ugbua?,Akụkọ ga-amasị gị,"Abịa n'obodo ndị kacha mma ibi n'ụwa, Sydney, Vancouver, Ọsaka nakwa Toronto so na ndị kacha mma, ebe Legọs, Karachi na Dhaka so na ndị kacha njọ." afirika-46902575,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46902575,Atiku Abubakar na Saraki nọ Amerịka,Akụkọ dị mkpa:,"Atiku azochiela na mba Amerika Okwu banyere njem onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP bụ Atiku Abubakar gara na mba Amerịka bụ ihe a kpụ n'ọnụ ugbua. Atiku zochiri n'Amerika ụbọchị Tọzde, nke mere ya ihe karịrị afọ iri o jiri tụ ụkwụ na mba ahụ. Atiku onye kwupụtara nkea n'igwe okwu Twitter ya kwuru na ya bịara maka mkparịtaụka ya na ndị ọrụ gọọmentị Amerika nakwa ụmụ Naijiria bi ala ahụ. End of Twitter post, 1 Nke a na-eme dịka ụfọdụ na-ekwu na o nweghị ike ị ga mba ahụ n'ihi ebubo nrụrụ aka na-eche ya na mba ahụ. Ihe na-ewu na soshal midia Akụkọ na Atiku abanyela Amerịka butere ọnụ n'etiti ndị ihe ya na-amasị n'elu igwe okwu soshal midia. @bolanle_cole kwuru na ọ ga-ebutere ndị ihe Atiku na-asa afọ obi ịdamba. @ebuka_akara jụrụ ụfọdụ ụmụ Naijiria ndị kwuru na Atiku agaghị abali Amerịka kedụ ka eke si anya anwụ. Mana ụfọdụ ndị ihe Atiku anaghị amasị kwuru na ihe o jiri nwe ike ganwuo bụ na ya na Bukola Saraki, onye ha kwuru nyere ya nchekwa ka ndị gọọmenti Amerika ghara ịnwụchi ya(diplomatic immunity). @SviewLily kwuru na ọ bụ maka na a kpọchiri ọchịchị mba Amerika ka Atiku jiri nwelie ike ị ga- ebe ahụ. Aka anyị adịghị na nsogbu APC- Gọọmentị Abia steeti Okezie Ikpeazu nke PDP were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Gọọmenti Abia steeti agọọla aka na ụkwụ ha, na aka ha adịghị n'ọgbaghara dị na otu pati APC na steeti ahụ. Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ John Okiyi kwupụtara nke a n'ọsịsa ebubo nke onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole boro na ọ bụ gọọmenti PDP n'Abia na akwanyere Ikechi Emenike, onye na-azọsara uche Ogar ikike iji ọkọlọtọ APC na steeti ahụ. Okiyi kọwara ebubo a dịka nke na-atọ ọchị, ma kwuo na nke a """"egbeọnụ ndị enweghị ihe ha chị na ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị enweghị ike ịchịkọba onwe ha ọnụ maka usoro ọchịchị."" O kwukwara na otu pati PDP na steeti ahụ na-akwado gọvanọ Okezie Ikpeazụ, bụ onye ọ kọwara dịka ọkacha mma na Naijiria taa. Agaghị m ada mba n'ibuso ndị na-eme nrụrụaka agha na Naijiria - Buhari Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari ekwusiala ya ike na ọ ghaghị ibu agha megide ndị Naijiria bụ ndị e ji mpụ na nrụrụaka mara. O kwuru nke a mgbe ọgara achụmnta vootu na Wọrị nke dị na steeti Delta. Buhari kwusiri ya ike na ya agaghị ele anya na-azụ n'ịkwụsị ọgụ nke ọchịchị ya na-alụ megide mpụ, ma kwee nkwa na ya agaghị agharịpụ ntụkwasị obi nke ndị Naijiria nwere n'ebe ọchịchị ya nọ. Ọ bụ ịhe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị butere mkpụpụ CJN n'ụlọikpe - Shehu Sani Sinatọ Shehu Sani akọwaala atụmatụ a ọchịchị etiti ji chọọ ịkpụpụ okaikpe ukwu Naijiria n'ụlọikpe nke Code of Conduct dịka nke a chọrọ ime n'ihi ntụliaka nke Febụwarị. O kwuru nke a mgbe a na-agba ya ajụjụ n'ihe omume Channelstv a kpọrọ 'politics today'. Onye sinatọ a si steeti Kaduna, kwuru na ihe a na-eme ugbu a bụ atụmatụ gọọmenti etiti ji chọọ iwakpo ngalaba na-ahụ maka iwu na Naijiria, ka ha wee nweta mmeri. Ọdụziri gọọmenti etiti ọdụ ka ọkwụsị ịga n'ihu na mbọ a ọ na-agba iji menye ọkaikpe Ọnnọghen ihe ihere. A gbagbuola onye ntaakụkọ nzuzo mba Ghana A gbagbuola Ahmed Hussein, onye ntaakụkọ mba Ghana soro wee kpughe nrụrụaka dị na otu egwu bọọlụ mba ahụ. Nchọpụta Hussein soro mee mere e jiri chụọ onyeisi otu FA nke Ghana. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na-enyocha ihe merenụ. Jose Mourihno: Ike agwụbeghị n'ọrụ nchịkọta Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England N'egwuregwu, Jose Mourihno ekwuola na ya ka dị obere ịla ezumike nka n'egwuregwu bọọlụu, na ya ka chọrọ ịna-arụ ọrụ ịchịkọta bọọlụ. Okwu ya na-apụta dịka a chụchara ya n'orụ dịka onye nchịkọta otu egwu Bọọlụ Man.United. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Atiku sị na mpụ ga-adi na ntuliaka 2019 Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anọghị n'ọchịchị bụ PDP bụ Atiku Abubakar ekwuola na obi esighi ya ike na mpu na aghụghọ aghaghị abanye ntuliaka na-abịa Atiku kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere. O kwuru na okwu afọ ole ọ dị abụghị okwu dị mkpa na ndọrọ ndọrọ a na-eme. O Kwukwara na ọ chọrọ ịgbanwe ndị isi ọrụ nchekwa ma rịọ ka ndị mba ofesi tinye anya hụ na aghụghọ abanyeghị na ha bụ ntuliaka. Na mkparịtauka ọzọ Atiku mere ụnyaahụ, o kwuru na ya agaghị echegharị maka ire ngalaba na-ahụ maka manụ agbịdi bu NNPC. Atiku si; ""a ga m ere NNPC!"", ma kwukwa na ya ga-eme ka ndị enye ya baa ọgalanya n'ọchịchị ya, ""mana ọ bụghị n'ọzọ ezighi ezi"". Buhari sị na ọgaghị abụ mbụ ma ya daa Yemi Osinbajo onye bụ osote onyeisiala Muhammadu Buhari bụ ọkaiwu nwere agba na Naijiria N'akụkọ yiri ibe ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ya bụrụ na ọ daa na n tuliaka a nke a n'abịa, ọgaghị abụ ihe ọhụrụ. Buhari kwuru nke a mgbe ya na osote ya bu Yemi Osinbajo na onye ntaakụkọ Kadaria Ahmed mere mkparịtaụka n'ogige nrụrụtaụka akpọrọ THE Candidates na NTA. Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo Kenya arịara Ndị wakporo ụlọoriri na Kenya Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo ụloọrịrị na mba Kenya eruola iri abụọ n'otu dịka ụlọọgwụ ebe ndị mmadụ na-enye ọbara pụtara ịkwu na ọbara ha nwetara ezuola. Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta kwekara nkwa na ndị kpara mkpamkpa a ga-ezute ntaramahụhụ n'aka ya. Nrụrịtaụka BBC n'Imo ga-akpọtụ echi Ọ ga-akpọtụ n'Owerri n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri na asatọ nke Jenụwarị a A ga-enwe nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo bụ nke BBC Igbo na-ahazi. Ebe ha ga-akọwara ndị Imo Steeti ọrụ ha ga-arụ ma ha baa n'ọchịchị. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Basket Making: Etu e si akpa nkata" media-45788084,https://www.bbc.com/igbo/media-45788084,Atiku dịka ọchịchịrị n'ebe Buhari nọ- APC,APC asaala mmeri Atiku,"Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress ekwuola na Atiku Abubakar abụghị onye Naịjirịa kwesiri ịtụkwasị obi maka ebubo dị iche iche gbasara mmeruaka dị ya n'ishi. Yekini Nabena bụ ọnụ na-ekwuchiri APC kwuru na Atiku bụ onye mba Amerika na-achọ maka mpu na aghụghọ nakwa ọ bụ onye na-efegharị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche makana ọ chọrọ ị bụrụ onyeisiala. Nabena kwukwara na ị họpụtara onye ga-achị Naịjirịa na-etiti Buhari na Atika dịka ị họrọ na-etiti ihe na ọchịchịrị Ndị ọrụ Anambra steeti etiila mkpu! Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa na Anambra steeti bụ Nigeria Labour Congress eboola gọọmentị steeti ahụ ebubo na ha anaghị akwụ ụgwọ ezumike nka dịka ha kwere nkwa. NLC kwuru na ha na-ebe ego ezumike nka n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ steeti a kamgbe afọ 2014 mana o nweghị ụlọọrụ akụ ezumike nka nke Bekee kpọrọ Pension Fund Administrator na-anata yabụ ụgwọ. Dino Melaye, Ben Bruce azaghị oku ndị uweojii Senatọ Ben Murray Bruce na Dino Melaye azabeghị oku ndị uweojii kpọrọ ha maka ngagharị iwe ha mere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ụbọchị ole na ole garaga n'Abuja maka ntuliaka ịhọpụta gọvanọ Osun steeti ebe APC meriri na yabụ ntuliaka. Cheta na ndị uweojii zigara ha ozi ka ha bịa ụlọọrụ ha taa n'Abuja maka ịza ajụjụ gbasara ebubo na ha mebiri ọtụtụ ihe mgbe ha na-eme ngagharị iwe a. Ethiopia emepela ụzọ ala ha N'Afrika, mba Ethiopia ekwuola na ha ga-akwụsị ịjụ ndị biara njem n'ala ha akwụkwọ ikike ịbata obodo site ugbua. Ha kwuru na ha mere mkpebi a maka nkwekọrịta pụtara na ọgbakọ ndị African Union gba sara akwụkwọ ikike na ndị na-aga njem na Afrịka. Lee ndị na-azọ ugo Ballon d'Or N'egwuregwu, Cristiano Ronaldo, Lionel Messi na Mohamed Salah esorola ndị ahọpụtara dịka ndị nwere ike ịturu ugo Ballon d'Or nke afọ a. Gareth Bale, Kevin De Bruyne, Eden Hazard na ndị ọzọ so kwa. Gee nkeji nke abalị a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri nke taa Ihe m ga-eme ma m nwee ohere ịchị Naịjirịa" afirika-46819760,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46819760,Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu,Akụkọ dị mkpa,"Ọkụ anapụla agadi nwaanyị ebe obibi Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu Ezinaụlọ Benedett Okeze ndị Ezimo dị n'okpuru ọchịchị Udenu Enugwu steeti, nọ na nnukwu anyammiri na ịta nkịkịrị eze n'ihi nnukwu ọkụ gbapịara ụlọ ha kpamkpam. Oge BBC Igbo gara ebe ihe mberede mere wee chọpụta na ọkụ ahụ malitere oge ọkụ latrik bịara n'uju gafee oke n'ime nderị, wee malite gbaba ọkụ. Agadị nwaanyị Benedette onye nwere nsogbu n'akpịrị enweghị ike itinwu mkpu oge ọkụ ahụ malitere. Ọ bụ nwa nwa ya dị afọ 13 gbapụrụ kpọta ndị agbataobi nyere ya aka dọpụta nne nna ya n'ọkụ. Ọtụtụ ndị Amaogbele Ezimo kọwara na ngwangwa ọkụ latrik biafere one, ọtụtụ mmadụ gara wepụsịa ọkụ ha ebe ọtụtụ ngwongwo eji ebi n'ụlọ dịka TV, Fridge, Fan Bulb na ndị ọzọ gbakwara ọkụ. Reuben Okeze bụ ọkpara agadi nwaanyị ahụ onye kọwara na ọ bụ naanị nwa ya nwoke gbara afọ 13 na nne ya nọ n'ụlọ oge ọkụ ahụ malitere kwuru na ọ bụ ndị agbataobi bịara dọpụta. Reuben, onye bị n'Abuja na-agba okada kwuru na kemgbe afọ 2018 bidoro ka ya jiri kpebie ịkpọrọ ndị be ya laghachi obodo ya bụ Amaogbele Ezimo ga birizie mana ọkụ ogbụgba atapịasịala ngwongwo ya bụlatara ụlọ. Ka ọ dị ugbua, Reuben kọwara na ọ bụ enyị ya nwoke nyere ya ohere ka obirigodu n'ụlọ ya rue mgbe ọ ga ahụ ego ruọ ụlọ ọzọ. Reuben Okeze na-ayọkwa enyemaka maka ịrụta ụlọ ọzọ n'ihi na ọbụ ịgba ọkada ka ọjị azụ ezi na ụlọ ya. Ọkụ ụgbọmmanụ agbaala ọzọ na Legọs Ụgbọmmanụ bu mmanụ nwuru ọkụ n'elu akwa dị n'Ifako Bridge dị n'Ogudu dị nso ọjọta. O nweghị onye ma ihe mere ụgbọ ahụ jiri nwuru ọkụ mana ndị ọrụ okporoụzọ Legos ndị a ma dịka Lastma kọwara na e menyụọla oku ahụ ma bụkwa ụgbọ ahụ gbara ọkụ. Oku ọgbụgba ahụ butere kpachi kpachi ụgbọala n'ụzọ si Third Mainland Bridge aga Berger. Ndị ọrụ na mba Zimbabwe ajụla mbulite ụgwọọnwa ha Ndị ọrụ bekee na mba Zimbabwe ajụla mbulite gọọmenti ha ji pasent iri bulite ụgwọọnwa ha. Ha si n'orughị ihe ha chọrọ. Ha chọrọ ka ụgwọ opekatempe ha bụrụ otu puku, narị dọla asaa,irir atọ na atọ. Ha kwuru na nke bụ iji belata ahụhụ n'ihi oke ihe isi ike dị na mba ahụ. Zimbabwe nọ n'ezi ihe ụka dịka akụnaụba ha kpụụla afọ n'ala. Onyeisiala ha bụ Emmerson Mnangagwa na-akwado njem mba gụnyere Russia iji rịọ ndị ojiegoachụego ka ha tinye ego na mba Zimbabwe. Anyị agaghị egbochi onye ọbụla ibinye aka - MASSOB Otu MASSOB ekwuola na ha agaghị egbochi nwafọ Igbo ọbụla isonye na ntuliaka nke na-abịa kama na otu ha agaghị eso na ya bụ ntuliaka. Onyeisi mgbasa ozi ha bụ Samuel Edeson gwara BBC Igbo na MASSOB ka kwenyesiri ike na nwereonwe Biafra site n'usoro udo. Anyị apụghị ịgwa INEC ihe ga-eme maka Zakari - European Union Otu European Union n'ụbọchị Fraịde ajụla mkpesa PDP nyere ha n'isi ụlọọrụ INEC banyere ọrụ ha nyere Amina Zakari. Osote onyeisi nyocha ndị otu a bụ Hannah Robert kwuru na ha enweghi ikike ịgbanwe ihe ọbụla karịa naanị ịtụnye aro. Na mba Congo Martin Fayulu bụ onye e meriri na ntuliaka onyeisiala mba DR Congo aṅụọla iyi na ọ ga-agba akwụkwọ n'ụlọikpe banyere ntuliaka ahụ. Fayulu gwara BBC na ndị mba ahụ kwesiri ịma nke bụ eziokwu na ntuliaka ahụ nke mpụtara ya tarala isi ọtụtụ mmadụ. N'egwuregwu Onye ama ama n'egwugwuregwu Tennis bụ Andy Murray ekwuola na o cheghi na ọ ga-akụli bọọlụ Tennis rue ọnwa anọ na-abịa abịa. Nwa amadị a ji anya mmiri akwa kwuo nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mgbape egwuregwu Australia Open. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akpụpụla ndị 'zuru' akpati ego Mugabe ụlọikpe Ex-President Robert Mugabe was ousted in 2017 Akpụpụla mmadụ atọ ụlọikpe bụ ndị eboro ebubo imaburu akpati ego Robert Mugabe bụ onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe. Akụkọ kwuru na ndị a ji puku dọla narị na iri ise dị n'akpati ahụ gaa zụọ ala, ụgbọala na ihe ndị ọzọ. Eche na ọ bụ otu ikwu na ibe Mugabe nyere ha igodo ha ji tụghee ụzọ. Ihe Buhari gwara BBC Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị ntaakụkọ ka ha gbaa mbọ na-agbasa ozi ziri ezi Buhari kwuru nke a mgbe ya na onyeisi BBC world Service bụ Jamie Angus zutere n'obi gọọmentị Naijirịa dị n'Abuja. Ọkụ IMSU Obi wụnyere ndị mmadụ n'afọ ka ọkụ malitere ịgba na ngalaba Faculty Of Humanities nke dị na mahadum Imo State e ji IMSU mara. Ndị hụrụ ka ọkụ a na-agba kwuru na o nọruru otu awa ma gbarie ihe ndị nọ n'ime ụlọ ahụ a malitere ịrụgharị n'afọ gara aga. Nafdac anwụchịela ụgbọala bu ọgwụike Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka, na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara maka 'kpoli ndụ' Ngalaba na-ahụ maka ọgwụ na nri akpọrọ Nafdac, anwụchiela otu gwongworo bu ọgwụike gụnyere kodine, n'ụzọ Oshodi dị na Legọs. Nafdac kwuru sị na ọgwụ a si Seme dị n'oke ala Naịjirịa na Bene Repọblik bata. Onye egwuregwu Kongo bụzị onye omeiwu Onye egwuregwu ọzọ abaala ọchịchị, mana ugbua ọ bụzị na mba Demokratik Repọblik nke Kongo. Robert Kidiaba bụbu aka na-echere ha goolu e ji ịsụ ike n'ala agba egwu ma ndị otu ya nye goolu mara, bụzị onye omeiwu na mpaghara Upper Katanga Province. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: 'Anyị mụzị anya ugbua'" afirika-47975126,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47975126,Under 17 Championship: Golden Eaglets azọọla Uganda ụkwụ n'isi wufe Semi final,Akụkọ kachasị tata,"Golden Eaglets abanyela agba osote ngwụcha Golden Eaglets nke Naíjiría Agbanyeghị tigbuo zọgbuo ndị a, ndị otu egwu bọọlụ Super Eaglets etinyela anyị ọchị n'ihu. Ha ejiriala otu ọkpụ otu ọkpụ gbaara ogbo ha nke Uganda ụgbọ nwamkpị n'asọmpị akpọrọ under 17 nations cup Ha wuferela na agba bụ osote nke ngwụcha n'asọmpi ahụ. Otu ezi na ụlọ nwụrụ n'Ebonyi Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi steeti bụ Loveth Odah ekwuola na ọgụ na ada n'etiti Ikwo na Izza ataala isi mmadụ asatọ ọzọ. Mmadụ ise n'ime ha sị otu ezinaụlọ bụ ndị gara ịnọnyere nwa ha mere emume ịbanye mahadum. Maka ndị ntọ na Kaduna Na Kaduna ndị ntọ egbuoala nwanyị bịara njem nleta na otu onye ọzọ ma tọrọ mmadụ atọ n'Okpuru ọchịchị Kajuru n'ụbọchị Satọde. Nke a mere ka mmadụ iri na otu nwụrụ n'aka ndị amakekwụ na steeti Benue n'isi ụtụtụ ụnyahụ Ogbunigwe na Sri Lanka N'ofesi, Mazị tigbuo zogbu akarịa n'ụwa ugbua. Nke na-eme ugbua bụ na-agbaala ogbunigwe isii na ụlọụka nakwa ụlọoriri na nkwari na Sir Lanka ebe ndị mmadụ na-agba Easter. Mmadụ iri abụọ awụọla ebe otu narị mmadụ na ụma iri isii merụrụ ahụ. Gee nkeji Igbo Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasi gị" afirika-44666415,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44666415,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Aka anyị adịghị n'ogbunigwe ahu - Ipob,Ipob agọpụla onwe ha,"Amabeghị ebe onye ndụ Ipob bụ Nnamdi Kanu nọ rụọ taa Otu Ipob akwọpụla aka ha n'ogbunigwe ahụ a turu na be onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo. Odeakwụkwọ mmgbasa ozị ndị otu bụ Emma Powerful sị na ebubo a so na nkata ọjọọ a na-akpa iji mee ka uwa hụwa otu Ipob dịka ndị omeketereihepụụjo. Cheta ndị uweojii kwuru na ha ji mmadụ abuo a na-eche na bụ ndị otu Ipob bu ndi a sị na ọ bu ha tụrụ ya bụ ogbunigwe Ndị gọọvanọ akatọla mkpamkpa akpara na Jọs Isi mmadụ ruru narị abụọ nara na Jọs Otu jikọrọ ndị gọọvanọ na Naịjirịa agbakọla aka katọọ ogbugbu egburu ihe ruru mmadụ narị abụọ na okpuru ọchịchị Barkin Ladi na Riyom nke Jọs, Platu steeti. Otu a, nke onyeisi ha bụ Abdul'aziz Yari nke Zamfara Steeti, kasiri ogbo ha nke Platu steeti bụ Simon Lalong obi ma kwe ya nkwa na ha ga-ahụ isi ihe a mere. Ụmụaka kpafuru na mba Thailand US na Briten entinyele aka na-ịchọ ụmụaka ahụ na onye nkuzi ha Tata bụ abalị itoolu ụmụaka iri na abụọ bụ ndị si otu egwuregwu bọọlụ Wild Boars Soccer Team na onye nkuzi ha funyuru anya n'ime mpio dị n'ime ugwu a Tailand. Ndị ọrụ gbata gbata si mba ofesi na ndị nke Thailand na-agba mbọ ịchọta ụmụaka dị na agbata afọ iri na otu na iri na abụọ. N'egwuruegwu Iko mbaụwa France na Argentina ga achịpụ ya taa Agantina na France abanyele agba nke abụọ tata Tata n'egwuruegwu, ka France na Argentina ga achịpụ ya na elekere atọ nke ehihie a ebe Uruguay na Portugal ga-hukwa isi ya mgbe ọkụrụ elekere asaa kpọmkwem. Nke a pụtara na agba nke abụọ iko mbauwa akwụrụgo chim. Gee akụkọ anyị n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị Onye eboro ebubo" afirika-47141469,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47141469,El Rufai: Ekwughị m okwu ụgha gbasara ndị mbịara mbịara,Akụkọ dị mkpa,"Aka na-achị Kaduna steeti apụtala ị zara ọnụ ya gbasara ebubo okwu ụgha eboro ya. O si n'aka onye enyemaka ya n'ihe mgbasa ozi bụ Samuel Aruwan zipu ozi kọwara na ihe o kwuru abụghị okwu ụgha ga-ebute ọgbaaghara Ebe ọnụ na-ekwuchitere otu PDP bụ Kola Ologbondiyan ekwuola na ha ga-agbahapụ nkwekọrịta ụdọ (Peace Accord) nke ha na otu ndịọzọ binyere aka n'afọ gara aga n'ihi omume El-Rufai. El-Rufai kwuru mgbe NTA gbara ajụjụ ọnụ na ""onye ọbụla chọrọ ị bute ọgbatuhie na Naịjirịa, anyị na-eche ha, ha ga-alaghachị n'akpa ozu"" Ọzọ, PVC ndị anatabeghị Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ha akagbuola PVC ruru otu puku bụ nke ndị mbịara mbịara denyere aha ịnata. Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a mgbe ọ na-akọwa etu ha si akwado ntuliaka 2019. Na mba ofesi, Otu ụlọ elu n'obodo Istanbul nke Turkey adaala n'ike ụbọchị Tọọzde ma gbuo otu onye. Akụkọ na-ekwu na a ka na-achọ mmadụ anọ ebe ụfọdụ ụgbọala nakwa ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ. N'egwuregwu, Onye ọpịa Tennis bụ Petra Kitova pụtara n'ụlọikpe taa inye okwu akaebe gbasara okwu onye sụrụ ya mma n'afọ 2016. Kitova kọwara etu o si jiri ego zọpụta ndụ ya n'aka onye ahụ e chere na ọ chọrọ ịgbu ya. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ntuliaka 'Referendum' ndị ASUU Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Ntuliaka nke otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum mere iji mara ka ha ọ ga-akwụsị abụbọ ọrụ nke nọrọla ọnwa atọ gosiri na ọtụtụ n'ime ha chọrọ ka abụbọ ọrụ ahụ gaa n'ihu. Na Mahadum nke Ibadan, ihe karịrị mmadụ narị abụọ binyere aka ka abụbọ ọrụ ahụ gaa n'ihu ebe ihe karịrị naanị mmadụ iri ise binyere aka ka ọ kwụsị. Akụkọ kwuru na ihe mere ụfọdụ ndị nkuzi mahadum jiri họrọ ka ọ gaa n'ihu bụ maka enweghị ntụkwasị obi ndị gọọmentị n'imezu nkwa ha kwere. ""Eji m aka na iwu a abụghị iji tinye ụjọ n'ime ụmụafọ Igbo ka ha ghara ịpụta binyeka na ntuliaka na-abịa abịa? "" Nke a bụ okwu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo n'ihi iwu onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere ka akpachie ndị na-achọ nnwereonwe Biafra n'oge ntuliaka a. Ihe Ohaneze jiri kwụnyere Atiku - Nnia Nwodo N'ofesi Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na Onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-un ga-enwe mkparịtaụka ọzọ banyere ngwaagha nuklịa. Trump kwuru na nke a ga-eme na mba Vietnam n'ụbọchị iri abụọ na asa rue iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe Nkiri Fashion Designer: E bidoro m kwawa akwa mgbe m dị afọ 14 - Emeka Nwokocha" afirika-47154848,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47154848,ASUU: Ụmụakwụkwọ mahadum ga-ebido akwụkwọ echi,Akụkọ dị mkpa,"End of Twitter post, 1 Ugbua ka ha kwuputere ya site n'akara Twitter ha na abụbọ ọrụ ha bidoro kemgbe ụbọchị 5 n'ọnwa Nọvemba akwụsịla. Nke a bịara dịka ASUU na gọọmentị etiti nwechara nzụkọ imeụlọ taa ma kwuo na akwụkwọ ga-ebido echi. Ha kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị emezughi nkwa asatọ ha kwere n'ime nzụkọ ahụ, na ha ga-ebido abụbọrụ ha ọzọ. Na ndọrọndọrọ, Otu kpọrọ onwe ha 'Red Card Movement' agọrọla aka ha na ụkwụ o nweghi otu ndọrọndọrọ ha kwụnyere. Nke a bịara dịka a na-anụ kepukepu na ha gbahapụla Oby Ezekwesili na-akwadozi Atiku Abubakar na ntuliaka na-abịa. Nakwa, Na mgbede ụbọchị Tọọzde ka otu na-achụso ọchịchị ziri ezi , BBC na mba Naịjirịa nakwa TVC gbakọrọ aka hiwe nrụrịtaụka ndị osote onyeisiala na Naịjirịa. Ọ malite n'elekere asaa nke mgbede, ebe egosikwa ya n'elu igwe okwu BBC niile gụnyere Pidgin, Yoroba, Igbo na nke Awụsa. Na mba ofesi, Ọgbakọ mba ndị Yurop bụ EU n'aha ịchafụ ekwuola na ha ga-aga ihu n'ilebanye anya na ntuliaka Naịjirịa nke n'abịa. Cheta na Gọvanọ Kaduna steeti Nasirel-Rufai kwuru na ndị mba ọzọ chọrọ ileba anya na ntulika Naịjirịa na-aga e ji akpa ozu bula ha. N'egwuregwu, Otu Super Eagles nke Naịjrịa ejirila ọnọdụ abụọ datuo n'ọkwa FIFA nakwa nke Afrịka n'ọnwa Jenụwarị. Ugbua Naịjirịa nọzị n'ọkwa iri anọ n'isii n'ụwa niile nakwa ọkwa nke anọ n'Afrịka. Akụkọ BBC Igbo na nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị agha Naịjirịa enwetela ụgbọelu ọhụrụ Ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọelu na mba Brazil bụ Embraer ekwuola na ha ga-eresi ndị agha Naịjirịa ụgbọelu dị iri na abụọ ha ga-eji buso Boko Haram agha. Embraer na ogbo ya bụ Sierra Nevada Corporation nke mba Amerịka enwela nkwekọrị ịhụ na ụgbọelu ndi a ruru Naịjirịa aka. N'aka nke ọzọ onyeisi ndị agha ụgbọelu Naịjirịa bụ Sadigue Abubakar ekwuola na ha enwetala ụgbọelu dị iri abụọ na abụọ na nso nso a. O kwuru na nke bulitere ọnụọgụgụ ụgbọelu ha site na pasentị iri isii n'afọ 2015 rue pasentị iri asatọ. PDP akatọọla mgbanwe ndị Kọmishịọna uweojii Pati PDP nakwa CNPP agbarụọla ihu na mgbanwe e mere n'ebe ndị kọmishịọna uweojii nke Steeti dị iche iche na Naịjirịa. Ha kwuru na mgbanwe a mere na n'oge a na-egosi na pati APC nwere nkata ha na-akpa banyere ntuliaka na-abịa abịa. N'ofesi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na a ga-emeri ndi omekome Islamic State kpamkpam n'izuụka na-abịa. Trump kwuru nke a na nzukọ mba ndị na-ebusokọ ndi omekatapụọ ụjọọ a agha mere. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ipob boycott: Ihe ndị mmadụ na-ekwu" afirika-45068371,https://www.bbc.com/igbo/afirika-45068371,Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị agha ụgbọelu 'egbuola ndị omekome 20',Akụkọ ndị dị mkpa,"Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa atụọla ogbunigwe ma gbuo ndị na-eyi ndụ egwu dị iri abụọ n'obodo Yanwari na Mashema nke Zamfara steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị agha ụgbọelu bụ Ibikunle Daramola bu onye zipuru ozi banyere mwakpo a. Minista na-ahụ maka ọkụ bụ Babatunde Fashola ekwupụtala na ọkụ Latrik Naịjirịa na-ewepụta ugbua dị megawatt puku asaa Fashola gara n'ihu kwuo na ministri ya arụọla ọrụ pụtara ihe n'ime afọ atọ gara aga kama na-enwere ọtụtụ ihe ka fọdụrụ. Na mba ofesi, Ndị Nọt Korịa nwalere ọtụtụ ngwaagha nuklia ha n'afọ 2017 Akụko ndị nchekwa United Nation wepụtara ụnyaahụ na-egosi na mba Nọt Korịa ka na-aga n'ihu na mmepụta nakwa orire ngwaagha nuklia. Dịka ọ dị ugbua mba Nọt Koria ekwubeghi ihe ọbụla banyere akụkọ a ma ọ bụ eziokwu, ka ọ bụ asị. N'egwuregwu, Ụmụafọ Naịjirịa gụnyere Blessing Okagbare, Joy Udo-Gabriel, Tobi Amusan na Rosemary Chukwuma atụrụla ugo ọlaedo n'ọsọ relay n'egwuregwu atiletiks na-eme n'Asaba. Ebe Semenya nke mba Saụt Afrịka maburu ọlaedo nke ya n'ọsọ mita narị anọ. Ihe nkiri nke taa Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra." media-46546402,https://www.bbc.com/igbo/media-46546402,FRSC ehiwela ụlọikpe mbugharị n'okporoụzọ,Akụkọ dị mkpa,"Ulọọrụ 'Road Safety' ehiwela ụlọikpe mbugharị Ụlọọrụ na-ahụ maka Ejealọ njem ụgbọala bụ Road Safety ekwuola na ụlọikpe mbugharị dị narị abụọ na otu nke ha hiwere maka ndị nnupuisi n'iwu na-achị okporoụzọ ga-amalite ọrụ na Monde. Onyeisi ha bụ Boboye Oyeyemi kwuru na onye ọbụla nupuruisi n'iwe ndị a ga-agba ekeresimesi nke ya n'ụlọ mkpọrọ. Mkparịtaụka ndị ndu Chad Basin Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang. Agha Boko Haram ga-agwụ site n'amara Chineke, Nke a bụ okwu onyeisiala Buhari gwara ndị ogbo ya si mba ndị ọzọ mejupụtara Chad Basin n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja. Ọgbakọ ha a bụ maka ịkpa nkata ụzọ ọhụrụ eji ebuso Boko Haram agha karịsịa n'oke ogbugbu ndị agha mba ndị a. N'ofesi Ndị yi uwe odo odo eme ngagharịiwe na mba Fransị e nupula isi na mmachị gọọmentị ma gaa n'ihu na ngagharịiwe nke werela izuụka ise. Nke a malitere n'ihi ntinye ego n'ụtụisi mmanụ ụgbọala mana ọ baala n'okwu ndị ọzọ nke gụnyere inwogharị agụmaakwụkwọ. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri BBC African Footballer of the Year 2018: Mohammed Salah atụrụla ugo Ndị Uweojii adọọla ndị omekaome aka na ntị Ndị ụweojii n'Anambra steeti akala ndị na anata oriri ekeresimesi obi, sị ha natawa na egwu adịghị. Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na ndị otu ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-anọ ebe niile ma dọkwaa ndị na-agba egbe aṅụrị Bekee kpọrọ ""Knockout"" aka na ntị ha sepụ ya bụ aka enwe n'ofe n'izu a. Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachi UNICEF Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachị ha machiri otu UN na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka akpọrọ Unicef. Cheta n'ụbọchị Fraịde na ndị agha Naịjirịa boro Unicef ebubo na ha na-agbara ndị omeketereihepụụjọ Boko Haram ama. Ọ teela ndị Izrel mewere ka ụwa kwete na isiobodo ha bụ Jerusalem N'ofesi, mba Australia esorola na mba nab atara West Jerusalem dịka isiobodo mba Israel. Praịm Minista mba Australia bụ Scott Morrison sịkwa na ha nabatakwara ndị palistain ịkwụrụ onwe ha dịka mba nke ha, ma were East Jerusalem mere isiobodo ha. Mo Salaheturula ugo ọkaibe nke Afrika Mo Salah BBC African Footballer nke 2018 N'egwuruegwu, Mohammed Salah nke Ejipt eturula ụgọ ọkaibe nke BBC African Footballer nke afọ 2018. Salah dị afọ iri abụọ na isii (26) bụ onye kacha nye goolu n'asọmpi ""Premier League"" ma bụrụkwa onye nyere goolu niile Egypt nyere na iko mbaụwa. Gee Nkeji ụtụtụ Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Akụkọ ga-amasị gị" afirika-44410377,https://www.bbc.com/igbo/afirika-44410377,Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wepụta akwụkwọ ntụliaka 1993 - Sinetị,Akụkọ kachasị mere taa;,"Sịnetị agwala INEC ka ha wepụta akwụkwọ ntuliaka 1993 Ndị ụlọomeiwu Sịneti agwala INEC ka ha wepụta akwụkwọ ntụlịaka nke juun afọ 1993 bụ nke na-egosi na MKO Abiola meriri ntụlịaka onyeisiala n'afọ ahụ. N'aka nke ọzọ, Ohaneze ndigbo na ndị ọnụ na-eru n'okwu agwala gọọmenti etiti ka ha kwanyere Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka ahụ ugwu dịka e si me Abiola. Osote Onyeisiala bụ Osinbajo agbanarịla ihe mberede Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo gbanarịrị oke nsogbu dịka ụgbọelu Helilọpta bu ya ga n'ụlọọrụ na-ahụ maka ibubata ngwaahịa dị n'Abuja gbaturu n'ike mgbe ọ na-achọ ifepu Osinbajo gara emume mpụta n'agụmaakwụkwọ ụfọdụ ndị isi ụlọọrụ ahụ mgbe ihe a mere. Mba Ofesi; Kim Jong-Un nwereike iga mba Amerịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na onwereike ịkpọ ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-un oku ka ọ bịa mba Amerịka ma ọ bụrụ mkparịta ụka na Singapore gaa nkeọma. Trump kwuru nke na nzuko ya na Praịm Mịnịsta Japan bụ Shinzo Abe. N'egwuruegwu, Onye na-agbara Naịjirịa bọọlụ n'ebe etiti bụ Ogenyi Onazi akatọọla akụkọ na-ekwu na ya onye ndụ ya bụ Mikel Obi nwere esemokwu. Onazi kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ naghị eme nkeọma n'asọmpi ugbu a, mana o metutaghị mmekọrịta ya na Mikel. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri taa Di na nwunye mụrụ ejima atọ" afirika-47158519,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47158519,AFCON U20: Otu bọọlụ mba Naịjirịa emeriela nke Nijey,"Na ndọrọndọrọ,","Akụkọ dị mkpa taa Otu bọọlụ Naịjirịa nke ndị erughị afọ 20 etozuola ịga asọmpị Iko Mba Afrịka dịka ha ji otu ọkpụ goolu merie mba Nijiey mgbe ha zutere onwe ha taa. End of Twitter post, 1 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec adọọtịala ohere ha nyere ndị mmadụ ịji nata PVC ha site n'ụbọchị Fraide ruo ụbọchị Monde Ọ gụnyere ụbọchị satọde nakwa ụbọchị ụka site n'elekere itoolu nke ụtụtụ rue elekere isii nke mgbede kwa ụbọchị. Ebe otu Citizen Forum, nke onye na-ede akwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka kpokọbara adọnyerela Kingsley Moghalu nke otu YPP ukwu maka ọkwa onyeisiala na 2019. Joe Igbokwe nke APC na Ugochukwu Ikeakor nke PDP akpọọla Ndigbo oku ka ha pụta tụọ vootu ụbọchị ntuliaka iji kwado mwulite Alaigbo. Ha kporo okwu a na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere na Facebook n'ubọchị Fraide. N'egwurewgu, Ụwa niile, ọ kachasị ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị pụtara ịgosi obi ntiwa ha dịka achọtara ozu Emiliano Sala bụ onye ọgba bọọlụ mba Ajentina nọ n'ime ụgboelu dara mmiri na mgbede tọọzde. Akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile N'ụtụtụ, A zọgburu ihe ruru mmadụ abụọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgbọ egwuregwu Jolly Nyame n'ọsọ achụmnta vootu APC mere na Jalingo Taraba Steeti. Onyeisiala Buhari kwuru na ọ na-ewute ya nke ukwuu ma ndị hụrụ ya n'anya tufuo ndụ ha n'ihi ịkwado ya. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ Obi ụtọ juru ụmụakwụkwọ mahadum afọ dịka otu jikọtara ndị nkuzi ha bụ ASUU akwụsịla abụbọ ọrụ ha bidoro kemgbe ọnwa atọ. Nkwụsị a bịara na ngwụcha nzukọ ndị isi ha na minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige nwere n'Abuja. Ebe onyeisi ndị ASUU bụ Abiodun Ogunyemi sị ka ndị nkuzi bido ọrụ ozugbo. N'ofesi, Onye kachasị enwe ego n'ụwa bụ Jeff Bezos kwuru na ụlo ntaakụkọ National Enquirer yiri ya egwu na ha ga-agba ihe o jiri bụrụ nwoke n'anwụ ma ọ gwaghị ọha okwu masiri ha. Ọ kwuru na Enquirer sị ya kwuo na ọbụghị ndọrọndọrọ mere ha ji ebu akụkọ gbasara ya n'akwụkwọ mgbasa ọzi ha. N'egwuregwu, Achọpụtala na ozu ahụ ahụrụ n'ime ụgbọelu ahụ kpọkasiri akpọkasị bụ nke onye otu egwuregwu Cardiff City bụ Emiliano Sala. Cheta na Sala mere njem na-aga Cardiff mgbe ụgbọelu ọ nọ na ya nke onye na-akwọ ya bụ David Ibbotson dabara na mmiri. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri taa: Mike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha" 46252136,https://www.bbc.com/igbo/46252136,Oby Ezekwesili ejirila ụkpa ekele malite ịchụ nta vootu ya,Akụkọ dị mkpa,"Ezekwesili bidoro otu #BBOG iji gbapụta ụmụaka Chibok Oby Ezekwesili ọ ga-azọtanwu ọkwa onyeisiala? O ji inye ụkpa ekele n'ụlọụka bido usoro ngagharị n'ime obodo nke Bekee kpọrọ ""campaign"" ya. End of Twitter post, 1 Ebe onyeisiala Muhammadu Buhari ga-amalite campaign nke ya n'ime Aso Villa dị n'Abuja, dịka Inec si nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ohere imalite ya. Moghaluonweela osote? Akụkọ na-eru anyị ntị site n'akwụkwọ ozi Guardian na-ekwu na Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa onyeisiala ahọpụtala Oriakụ Umma Getso dịka osote ya ka ha na-azọ ndọrọndọrọ n'okpuru pati ya bụ Young Progressives Party. Na mba ofesi, Ihe merụrụ ahụ na ngagharịiwe ndị mba Frans malitere ime n'izu a eruola mmadụ narị anọ. Cheta na ọtụtụ mmadụ ruru puku narị abụọ na iri asatọ pụtara ime ngagharịiwe maka mbuli mmanụ ụgbọala gọomentị ha na-akwado ime. N'egwuregwu, Enweghị ebe otu Tanzania nke Emmanuel Amuneke na-achịkọta, ji azụ aga ka ha na-achụ isonye Iko Mba Afrịka makana Lesotho meriri ha. Saụt Afrịka merikwara otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ ""Super Falcons"" n'egwuregwu nke mbụ ha na-agba n'asọmpi AWCON bụ Iko Mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Ha ga-ezute otu Zambia n'egwuregwu ọzọ ha ga-agba. Ebe Ịngland ji ọkpụ goolu abụọ merie Kroeshia n'asọmpi UEFA nations League. Ndị ụlọomeiwu ukwu ekwuola na ha nwere ike ịmalitere kọmịtii ga-enyocha osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo n'ihe gbasara ego Naịjirịa ruru ijeri naira iri atọ na atọ e tinyere aka maka ọrụ gbatagbata n'ọwụwa anyanwụ ugwu Naijiria. Mana Osinbajo na-ekwu na o nweghị njọ ya mere maka na ego ahu bụ ego enyemaka ga-akwado ndị bi n'Ugwu. Ihe mberede ụgbọala egbuola mmadụ na Ebonyi N'Ebonyi mmadụ ise anwụọla na ihe mberede ụgbọala mere n'Akpoha n'okporoụzọ Afikpo na Abakaliki. Cheta na mmadụ abụọ ọzọ nwụrụ n'ụbọchị ole na ole garaga n'okporoụzọ ahụ. WHO agbaala ọsọ ndụ na Kongo Otu World Health Organisation esepụla aka enyemaka n'ịkwụsị ọrịa Ebola na mba Kongo dịka ha kpọpụtara ndị ọrụ ha na mba ahụ maka nnukwu agha na-ada n'ala ahụ ugbua. Trump agaala ebe ọkụ na-agba na Kalifonia N'ofesi, onyeisiala Amerika bụ Donald Trump agaala obodo Kalifonia ebe nnukwu ọkụ legburu mmadụ iri asa na isi ma repịa ọtụtụ ụlọ. O kwuru na ọkụ mberede a bụ nke kachasị njọ n'ala ahụ . Lee ndị na-azọ ọkwa ọkachaagba bọọlụ Afịrịka Medhi Benatia, Kalidou Koulibaly, Sadio Mane, Thomas Partey na Mohamed Salah (site n'aka ekpe rue n'aka nri) bụ ndị a họpụtara. N'egwuregwu, Medhi Benatia, Kalidou Koulibaly, Sadio Mane, Thomas Partey na Mohamed Salah bụ ndị ga-azọ ọkwa ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka n'ime afọ na nturuugo nke ụlọọrụ BBC wepụtara. Cheta na ọ bụ Salah bụ onye nwetara nzerea n'afọ gara aga. Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị : Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a" afirika-51837356,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51837356,Igbo Culture: Ihe mere Igbo ji atụ Ikenga egwu,Ikenga bụ chi onye.,"Ọ bụ mmụọ ịkwụwa aka ọtọ, ike na ọganihu. Mụọ a bụ mụọ nwoke na ike dimkpa. Ikenga bụ atụrụatụ dịka ọ dị n'okpukerechi ndị ọzọ dị iche iche dị ụwa gbaa gburugburu site na okpukperechi ụka, Islam, Hinduism, Judaism na ndị ọzọ. Ndị a niile nwechere atụrụatụ ha na-elejere anya mgbe ha na-efe chukwu. N'omenala Igbo, a na-akpọ chi onye Ikenga. Ikenga bụ aka nri mmadụ, nke pụtara obi ọcha, ikwuwa aka ọtọ na eziokwu. Ihe eji anọchite anya Ikenga bụ atụrụatụ nwoke bu ihe n'isi ma jide ọdụ na oji n'aka abụọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-ebu mma abụọ nwere nko n'isi. Mgbe ọzọ o burukwa atụrụatụ dịka isi ụmụanụ. Ọ dị mkpa ịmata na ọbụghị osisi niile ka e ji atụ Ikenga. Ukwu oji obere Ndịgbo kwenyere na osisi ndị a nwere ike pụrụiche Chineke nyere ha o ji akpa ike. Ramas Okoyeasuzu, onyenlekọta omenala Igbo sị na ""osisi ndị a bụ Oji, ngwu na ogirisi"". Ikenga nwere ike nke mụọ oji arụ ọrụ maka ọbụghị Chukwu mana ọ bụ site na ya ka e si akpọkụ chụkwụ. Ramas Okoyeasuzu bụ onyeamụma omenala Igbo sị na Ikenga bụ Ike dimkpa eji ama onye bụ onye Ramas kwuru na nwoke ọbụla wagoro akwa, nụrụ nwaanyi kwesiri ịnwe Ikenga. O kwukwara na ""Onye ya na Ikenga ya dị na mma, ihe na-agara ya werewere"". Nke a gosiri na ikenga mmadụ kwesiri ịna edu ya njem ma na-ewetere ya ihe ọma. Ikenga ole ka e nwere? Nchọcha anyị nwere na-egosi na-enwere ụdịrị Ikenga dị iche iche. Ikenga dike Ikenga a bụ ụdị nke ana enye onye kpara ike n'obodo. Nke a na-abụkarị aturuatu mmadụ tukwu ọdụ nwere mpi na dịkwa egwu n'anya. Ọ na ejikwa ọdụ na obejiri n'aka abụọ. O na-ejikarị mma ahụ n'aka nri bụ nke akpọrọ aka Ikenga. Ọ bụ onye tozuru okorobịa na-enwe ikenga. Ikenga ọha Ikenga nke a na-adị nnukwu nwekwa atụrụatụ mmadụ na ụmụanụ n'ahụ ya. Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe, jide oji maọbụ mkpọrọ n'aka nri ya. A na-egbukwa ya ichi n'ihu. Ọ na-ebu nnukwu ibu maka a na-edowe ya na obodo maọbụ ama ndị nwe ya. Otu onye anaghị enwe ya kama ọ bụ nke ọha. Ikenga echichi Nke a bụ Ikenga a na-enye ndị chiri echichi n'ala Igbo. Ndị chiri ọzọ na-ejikarị ya. Ikenga a gosiri ike na ọkwa pụrụiche. Mgbe ụfọdụ a na-ejikwa igwe akpụ ụdị Ikenga a. Ọ na-ejikarị ọdụ n'aka ekpe nke gosiri Ike na ọchịchị Ihe ana emere Ikenga A na-erekwa Ikenga tupu amalite itinye ya n'ọrụ. Onye okenye n'ụmụnna chizuru echizu ka ọ bụ ọrụ ya ịmekwa Ikenga tupu e nye ya onye ọ bụ nke ya. A na-anọ n'ihu ọha maọbụ ụmụ nna mekwa ya bụ Ikenga. A na-eji ji, ọkụkọ, mmanya, ọjị na oseọjị achụrụ Ikenga aja izu ahụ. Enwekwara ike iri oriri ụbọchị ahụ dika aka ruru onwe nwe ya bụ Ikenga. Ya kpatara Igbo ji sị na Ikenga nwamgbenye na-atagbu onwe ya na ọjị. Onye nye Ikenga ezigbo ihe, ogbutere ya nnukwu anụ. Igbo sịkwa na Ikenga adighi ire awaa ya nkụ. Lee ike nkiri a Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo" 47565517,https://www.bbc.com/igbo/47565517,El-Rufai accident: Anọghị m n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma dịka akụkọ kwuru,Akụkọ dị mkpa:,"Nasir El-Rufai bụ aka na-achị Kaduna steeti na isi a hụrụ kwaba okpu na pati APC, ekwuola na onweghi ihe ọbụla mere ma ya ma ọkwọụgbọala ya, dịka akụkọ si na-efegharị. Akụkọ ahụ pụtara kwuru na ya bụ El-Rufai nọ n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma, ebe ọkwọụgbọala ya nwụrụ anwụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị ka akụkọ a si n'aka ndị na-akwado PDP, ma kwuo na ọ ka kwụ chịm. Content is not available End of Facebook post, 1 Asambodo mmeri, Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti na-apụ n'ọchịchị, esoghi na ndị natara asambodo ọchịchị ya taa. Nke a na-abịa ka ụlọọrụ INEC nyere ndị niile zọtara oche sinetọ n'ụlọọmeiwu ukwu Naịjiria, asambodo mmeri ha n'Abụja. Ụlọ dara na Legọs, Gọọmentị akwụsịla ịchọ ndị mmadụ n'ụlọelu ogogo atọ ahụ dara n'Ịta Faaji na Legọs, mana obi adịghị ndị mmadụ mma n'ihi na enweghi onye ma mmadụ ole nọ n'ụlọ ahụ oge ọ dara. Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na otu nwụrụ na ya bụ ihe mberede, ebe a gụpụtara mmadụ iri ise gụnyere ụmụakwụkwọ praịmarị. Akụkọ si mba ọzọ, Praịm minista ọhụrụ mba Ọljiria bụ Noueddine Bedoui, ewepụtala atụmatụ ọhụrụ iji zaa ngagharịiwe ndị mba ya mere iji kwụsị onyeisiala ha bụ Abdelaziz Bouteflika ịzọ ọchịchị ọzọ. O kwuru na gọọmentị ya ga-agụnye ndị ntorobịa Ọljiria bu ngagharịiwe a n'isi, ma kwuo na gọọmentị a ga-achị naanị nwantịntị oge. N'egwuregwu, Onye ka a ga-agbara ụgbọ nwamkpi na Europa League mgbe Chelsea ga-ezute Dynamo Kiev na mgbe Arsenal ga-ezute Rennes ọzọ? Inconclusive elections: 'Meenụ ihe niile ọ ga-ewe inye APC mmeri na mmeghari ntuliaka gọvanọ' Abdullahi Abass Onyeisioche APC na Kano steeti bụ Abdullahi Abbas akpọọla ndị agboro na-akwado otu pati ha ka ha ghara ile anya n'azụ ime ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na APC meriri na ntuliaka mmeghari nke Inec hiwere. N'ihe onyonyo na-efegharị na social midia(Twitter na Facebook) nke amaghị onye wepụtara ya, Abdullahi Abass onye gwara ha okwu n'asụsụ Awụsa kwere ha nkwa nchekwa ma ndị uweojjii nwuchịe ha, na a ga-atọhapụ ha na e gbughị oge. Cheta na Inec kwuru na ntuliaka e mere na steeti isii gụnyere Sokoto, Benue, Bauchi, Adamawa, Plateau na Kano ezughị nwe nkwubi na ha. Naijiria achọghịkwa Boeing 737 Max Gọọmenti etiti amachiela ụgbọelu Boeing 737 Max ifebata na Naijiria dịka ha na-ekwusi ike na o nweghị ụdị ụgbọelu ahụ na Naijiria. Mịnista nta na-ahụ maka njem bụ Hadi Sirika, bụ onye kwụpụtara nke a dịka ọ na-agwea ndị ntakụkọ okwu n'obi gọọmenti dị n'Abuja. Nke a na-eme dịka ụgbọelu Ethiopian Airlines Boeing 737 ahụ bu ndị mmadụ si isiobodo Addis addis Ababa na-aga Nairobi dị na Kenya, kpọkasịrị n'obodo Bishoftu. _______________________________________________________________ Lagos Collapsed building: Ndị nne na nna jupụtata n'ụlọọgwu ịchọ nwa ha Ndị nne na nna wakporo ụlọọgwụ 'Genereal Hospital Marina na legọ na ụlọọgwụ ndị ọzọ dị nso ịchọ ndị nke ha dịka akụkọ na o nwere ndị azọpụtaran'ụlọ dara na Legọs ụbọchị Wenezde. Oge BBC gara n'ụlọọgwụ ahụ, ọtụtụ ndị o metụtara jupụtara ma na-anata nleta n'ọnụmara dị iche iche dị n'ụlọgwụ ahụ. Onye nnukwu odeakwụkwọ Mịnịstry na-ahụ maka ahụike gwara Grace Ekpu nke BBC na a na-elezi ndị ahụ ka azọta ha ndụ tupu eziga ha n'ụlọgwụ ndị ọzọ. Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ. ______________________________________________________________________________________________________ Ule Jamb bụ Eprelu 11 Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Ngalaba na-ahụ maka ule eji abanye mahadum ehiwela abali iri na otu nke ọnwa Eprelu afọ dịka ụbọchị ule ahụ ga-amalite. A na-ele anya na a ga-eme ule ahụ otu izuụka. __________________________________________________________________________________________________________ Akingbola ji ego ụlọakụ zụọ ụlọ n'alabekee-EFCC Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Otu onye akaebe ebola onye bụbu onyeisi ụlọakụ Intercontinental bank bụ Erastus Akingbola ebubo izupu ego ụlọakụ ahụ karịrị nde dọla itoolu were zụọ ụlọ na Lọndọn. Abdulraheem Jimoh gwara Okaikpe Mojisola Olatoregun n'ụlọikpe ukwu nke etiti n'Ikoyi Legos n'akwụkwọ nke EFFC gbara Akinhbola nke na-aga n'ihu ugbua. _________________________________________________________________________ N'egwuregwu, Barcelona ji nkata kponye Lyon goolu Otu egwu bọọlụ Barcelona gosiri ihe ha ji wụrụ dachị ka ha ji nkata kponye Lyon goolu n'ọgbọegwuregwu Nou Camp, ebe Liverpool lara na nta n'agbanyeghị mmeri ha meriri n'asompi ha na Bayern sọrọ nabalị Wenezde." afirika-46121525,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46121525,Abubakar Shekau awụpụtala ọzọ ime ndị agha Naịjirịa akaja,Akụkọ dị mkpa,"Abubakar Shakau ezipụla ihe nkiri ọhụrụ gosiri oge ndị otu ya wakporo ndị agha Naịjirịa n'obodo Kumshe na Borno steeti na ngwụcha izuụka garaga. Ihe nkiri a rutere ndị ntaakụkọ Sahara Reporters aka gosikwara egbe na mgbọ dị icheiche ndị Boko Haram sị na ha napụrụ ndị agha Naịjirịa. Shekau pụtakwara n'ihe nkiri ọzọ na-eme ndị agha Naijirịa akaja. APC apụtaghị n'akwụkwọ Inec n'Imo N'Imo, INEC edepụtala aha ndị niile ga-azọ ọkwa dịka gọvanọ na steetị ahụ mana onweghị aha ọbụla pụtara n'okpuru otu pati APC. Cheta na Hope Uzodinma na Uche Nwosu bụ mmadụ abụọ ka na-azọ onye ga-azọ ọchịchị dika gọvanọ n'okpuru APC n'ulọikpe. Onye sụrụ ndị mmadụ mma anwụọla N'ofesi, nwoke sụrụ mmadụ atọ mma na Australia anwụọla n'ụlọọgwụ. Ndị uweojii akpọghị aha nwoke a mana ha sị na ọ dị afọ iri atọ na otu nakwa bụrụ onye mba Somalia. Jose Mourinho agwala Man U okwu ike N'egwuregwu, agbanyeghị na Man U meriri Juventus ọkpụ abụọ asatara otu, aka na-achịkọta ha bụ Jose Mourinho ekwuola na otu dị iche iche ga na-emeri Man U maọbụrụ na ha jụ na agaghị eto. Mourinho kwuru na ọdịghị mma na oge ọbụla ka ha na-esi azụ emere ndị ha meri n'asọmpi dị iche iche. Okorocha na Hope Uzodinma Gọvanọ Rochas Okorochas nke Imo steeti ekwuola na onweghi onye maara Hope Uzodimma bụ onye ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ na Steeti ahụ. N'akwụkwọ ozi si n'aka onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo, Rochas kwuru na Uzodinma abụghị onye APC. N'aka nke ọzọ onye isioche ndọrọ ndọrọ ọchịchị Hope Uzodinma bụ Declan Emelumba kwuru na Okorocha na-arọ nrọ n'okwu ndị a ọ na-ekwu. Naịjirịa bụ mba abụọ kacha anyụ nsị n'ezi Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa Naịjirịa bụ mba nke abụọ na mba ndị kachasị anyụ nsị na mbara ezi na mba ụwa niile. Nke a mere onyeisiala Buhari ji gbarụọ ihu ma tinye ọnọdụ gbatagbata n'ụlọọrụ na-ahụ maka mmiri, ịdị ọcha nakwa idebe ebe ọcha na Naịjirịa. Mba Ethiopia Ndị uweojii na mba Ethiopia ekwuola na ha achọpụtala otu ili nwere ozu mmadụ narị abụọ dị na agbata Somali na Oromia. Ntaakụkọ kwuru na a chọpụtara ili a oge a na-eme nyocha banyere ihe ọjọọ niile onye bụbu onyeisiala ha bụ Abdi Mohammed mere. N'egwuregwu Onye na-agbara Arsenal bọọlụ bụ Danny Welbeck enwetela mmerụ ahụ n'ime asọmpi ha gbatara ụnyaahụ. Onye nchịkọta ha bụ Unai Emery kwuru a na-eche na mmerụ ahụ buru ibu. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri A na-ajụ ma abụ m mmadụ - Nigerian Jackie Chan" afirika-46744782,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46744782,"Amina Zakari: PDP,Ohaneze akatọọla ọkwa Inec nyere ya",Akụkọ dị mkpa taa,"Ndị Naijiria akatọọla Inec maka ịhọpụta Amina Zakari Amina Zakari, nwa nwanne Onyeisiala Buhari bụbu onye ọrụ ahụike na-ahụ ọkwa ọhụụ ya a PDP, Ohaneze Ndigbo na ndị ọzọ akatọọla ọkwa dịka onye ga-akpọpụta onye meriri na ntuliaka onyeisiala Inec nyere onye ezinaụlọ Buhari akpọrọ Amina Zakari Onyeisi ọhaneze bụ NNia Nwodu kpọrọ oko ka Zachari tinye akwụkwọ arụkwaghị n'ihi na nhọpụta ya dịka ọnye ga-achịkọta vootu na 2019 dị ka ""Rangers ịhọpụta onye ga-egbu bọọlụ n'asọmpi ha(Rangers) na Kano pillars."" PDP kwuru site n'akara Twitter ha na anya ha dị n'ahụ Yakubu Mahmood onyeisi Inec ịhụ na ọ ga-eme ihe n'ụzọ ziri ezi. Oby Ezekwesiri kwuru na odoro anya na onyeisi Inec na-eme ihe na ụlọọrụ ya aghaghị ile anya n'ihu eme ihe ha. Onye nkuzi kwuru na ọkwa ahụ e nyere Amina Zakari edoghi onye ọbụla anya. A tọhapụla ndị okpukpe Juu e ji eji Atopụla ndị ụka Juu mmadụ iri ise na otu ndị uweojii tụnyere n'ụlọ mkpọrọ maka ime ngaghariwe n'Abia steeti. Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Revered Peace onye gbara BBC Igbo ama n' ozi o zitere kwuru na ọ bụ ndị ọkaiwu Ipob gbapụtara ha bụ ndị anwụchiri kemgbe abali iri na otu nke ọnwa Disemba. Ndị agha Naijiria akpọpụtala aha ndị otu ha nwụrụ n'ụgbọelu Boko Haram gbaturu Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kemgbe afọ 2015. N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Ibikunle Daramola wepụtara, o kwuru na ndị agha ise nwụrụ na ya bụ ụgbọelu nke dara oge ha na ndị Boko Haram na-akwata n'Ugwu-Awusa. Dịka Daramola si kwuo, ""ndị nwụrụ ma bụrụkwa ndị ahụrụla ozu ha bụ Flight Lieutenant Perowei Jacob - onye na-akwọ ụgbọelu ahụ; Flight Lieutenant Kaltho Paul Kilyofas - onye so akwọ ụgbọelu ahụ; Sergeant Auwal Ibrahim- onye ọrụ ụgbọelu; Lance Corporal Adamu Nura nakwa Aircraftman Meshack Ishmael."" Ụlọọrụ ntaakụkọ AFP kwuburu na ndị Boko Haram ahụ agbajiela ndịagha Naịjirịa aka ma chụpụ ha na ọnọdụ atọ ebe ha nọ na Borno Steeti ụbọchị Tuzde. Ndịagha ụgbọelụ Naịjirịa kwupụtaburu na otu ụgbọelụ ha jị alụ agha Boko Haram na Damasak, Borno steeti efunyụọla anya pịị. Ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Ibikunle Daramola kwuru nke a na-akara Twitter ha. Ohere ịchụta ego na Naijiria esiwanyela ike Naijiria agbadala na ngụkọ obodo kacha mma ịchụ nta ego na mba ụwa rue ọkwa otu narị na iri. Niajiria sị n'obodo nke atọ n'afrika n'afọ 2018 gbadara rue mba nke iri na anọ dịka ngụkọ nke ụlọọrụ ntaakụkọ Forbes siri kwuo. Ụlọikpe ajụla arịrịọ Dino Melaye Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla inye ndị uweojii wakporo ụlọ Dino Melaye iwu ka ha hapụ ụlọ ya. Melaye gbara akwụkwọ ịrịọ ụlọikpe ka ha nye ndị uweojii iwu ka ha sị n'ụlọ ya pụọ mana Okaikpe Maha nyere mkpebi ka anụ ikpe ahụ ngwa ngwa. Ikpe ndị gburu Jamal Khasoggi amalite N'ofesi, e bidola ikpe mmadụ iri na otu ana-ebo ebubo na ha gburu onyentakụkọ Jamal Khasoggi na mba Saudi Arabia. N'egwuregwu, Ndị otu egwuregwu Man city na Liverpool na-ezute onwe ha ụbọchị Tọzde n'asompị Premier League. Ọ bụru na Man. City emerighị n'asompi a Liverpool ga-eji pọint itoolu aga ha. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ọkụ bara n'ahịa n'Umuahia Ọkụ gbara Ahịa Timbershade dị n'Enugwu Ndị ahịa Aba Motor Park dị n'Umuahia akwaala arịrị maka ọkụ gbara ụlọahịa ha n'ụbọchị Wenzede. Ka a na-ama imi n'ala ịmata ihe kpatara ya bụ ọkụ, akụkọ na-akọ na ọ bidoro n'otu ụlọahịa ebe adowara mmanụ ụgbọala. INEC n'Enugwu ewepụtala akwụkwọ gosiri ka ntuliaka 2019 ga-adị Inec: Bia nara PVC gị Akwụkwọ a kwuru na ntuliaka Onyeisiala na ndị ndị omeiwu ga a bụ na mkpụrụ ụbọchị iri na isii nke onwa Febuary afọ a (Feb 16). N'ofesi, China sị na ụgbọelụ satilite nke ha kpọrọ Change 4 adaala na oteaka n'elu ọnwa Ụgbọ eluigwe ndị China Ụgbọelụ satilite nke ọnweghị onye na-anya ya gbara ụkwụ na ya bụ ọdịda anyanwụ ọnwa mgbe ọkụrụ elekere irị na ụma na Beijing. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri anyị nke taa ebe a: Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ" 48048367,https://www.bbc.com/igbo/48048367,Buhari agaala mba Briten,Buhari a ga ala Briten,"Akụkọ ndị dị mkpa taa: Kemgbe afọ 2015 ọ banyere ọchịchị, Buhari agaala njem mba ndị ọzọ ihe kariri otu afọ Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari azọpụla ụkwụ ije gawarala onwe ya mba Britain ụbọchị Tọzde. Dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ Femi Adesina siri kọwapụta n'ozi o wepụtara,Buhari ga-anọ njem ya rue abalị ise nke ọnwa Mee. A kpọghị okwu aka ihe ọ gara ime n'Alabekee mana e kwuru na njem ya enweghị ka o siri gbasa ọchịchị obodo. Buhari zopụrụ ije dịka ọ gbapechara ọrụ ụfọdụ na Maiduguri,Borno steeti. Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria Emir nke Kano bụ Mohammed Sanusi echiela Mike Zhang echichi ' Wakilin Yan Chanan' nke pụtara 'onye nnochite anya ndị China.' Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria Ọnụ na-ekwuru alaeze Kano bụ Saadatu Baba-Ahmed kwuru na nkwanyere ugwu na-esote mbawanye ndị ojiegoachụego ndị China na-etinye ego na Kano. Sịnetị akpọọla onyeisi ndị uweojii oku Ndị Sịnetị agwala onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ wụchie n'ihu ha bịa kọwaa mbọ ọ na-agba iji kwụsị oke ntọọ dị na Naịjirịa ugbua. Ha kwuru na oku a abụghị maka ịkatọọ ya mana ọ bụ ka ha tụkọta uche ọnụ mara ụzọ a ga-eji gboo nsogbu dị n'ịtọ mmadụ na Naịjirịa. Cheta nizuụka gara aga atọọrọ ma gbuo nwafọ mba Briten bụ Faye Mooney na ndị ọzọ na Kaduna Steeti. Buhari agaghị ekposa ndị mịnịsta ya ugbua - Lai Mohammed O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya. Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na oge erubeghi mgbe onyeisiala Buhari ga-eji ekposa ndị minista o ji arụ ọrụ. O kwuru na ọ bụ mgbe ha mechara nzukọ nke ikpeazụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee. N'ofesi N'ikpeazụ onye bụbu Osote onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwupụtala uche ya n'ịzọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka n'afọ 2020. O kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ihe onyonyo na ugwu eji mara mba Amerịka bụ ihe nọ zi n'ihe ihe ndụ ugbua. Biden na mmadụ iri na itoolu ndị ọzọ gụnyere sịnetọ Elizabeth Warren, Kamala Harris na Bernie Sanders ga-asọkata mpi n'inwete ọkwa a. N'egwuregwu Otu jikọtara ndị na-agba bọọlụ n'Ịngland akpọọla oku megide ịkpa oke agbụrụ dị n'egwuregwu bọọlụ Ha akwala ndị ọgba bọọlụ ka ha zite ihe na-egosi na akpasoro ha oke agbụrụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije' Ọkụ gbagburu mmadụ 19n'ihe mberede okporoụzọ Ọkụ a gbagbuola mmadụ iri na itoolu gara agbamaakwụkwọ dịka ụgbọala ha nwere ihe mberede nke ọkporoụzọ,ebe 23 merụrụ ahụ n'obodo a Gwaaram dị na Jigawa steeti. Akụkọ kwuru na mmadụ iri anọ na abụọ nọ n'ime ụgbọala na-ebu mmadụ iri na asatọ oge taya ụgbọala nke ihu gbara m, ụgbọala ha tụgharịa ụgboro ugboro tupu o nwuru ọkụ gbagbuo mmadụ iri na itoolu,ebe iri abụọ merụrụ ahụ. E bugara ha ụlọọgwụ 'Azari Federal Medical Centre ebe ha nọ anata nleta. World Malaria Day: Ịba ka na-akpa ike Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọmkpọrọ ahụ bụ ASP Effanga Etim, Ha kwuru na ha nyere ya ezi nleta dịka edebanyere aha ya n'ụlọgwụ General Hospital in Calabar maka nleta tupu a mụọ nwa ma bugakwa ya nnukwu ụlọọgwụ 'University of Calabar Teaching Hospital (UCTH' oge ọnọdụ ya kawanyere njọ. Dịka a na-eme ncheta ụbọchị ọrịa ịba n'ụwa gba gburugburu, otu WHO akpoola oku ka onye ọbụla tinye uchu n'agha a na-ebu megide ọrịa ịba dịka ha gbara ama na otu nwa na-anwụ kwa nkeji abụọ ọbụla n'ihi ọrịa a. Kwụọ anyị nde N20m maka ọnwụ Somtochukwu Ibeanusi- Ezinaụlọ ya Ụmụaka si n'ụlọakwụkwọ dị na Legọs ka nwereike ịtọ n'ime ụvụrụ ụlọ ahụ Ezinalụlọ Somtochukwu Ibeanusi, nwaata ahụ a gbagburu n'afọ 2017 oge ndị uweojii ji egbe achụsasị ndị mmadụ oge a na-emebi Ahia Eke Ukwu dị n'Owere n'Imo state chọrọ ka gọọmenti Imo kwụọ ha nde Naira iri abụọ dịka ego iti aka n'obi. Nna nwa ahụ tiri mkpu ahụ na ụlọ mkpesa pụrụ iche e hiwere iji lebanye anya na akpamike na mgbagbu ndị uweojii na-akpagide ọha mmadụ na Ndịda Anyanwụ Naijiria nke otu jikọrọ ndị ọrụ abụghị gọọmenti a kpọrọ 'Network on Police Reform in Nigeria (NOPRIN) hiwere n'Owere ụbọchị Wenezde. Ọrịa Meningitis egbuola mmadụ iri ise na asatọ, ebe ọrịa ahụ ji mmadụ narị asaa na iri isii na steeti iri na ise n'afọ a dịka ngalaba na ahụ maka mgbochi orịa na Naijiria bụ NCDC n'aha ịchafụ siri gbaa n'ama ụbọchị Wenezde oge e mere ncheta ụbọchị Meningitis na mbaụwa. Ụmụaka nde 160 agbaghị ọgwụ mgbochi arụrụbara Nchopụta ọhụrụ otu Unicef mere gosiri na ihe karịrị nde ụmụaka 160 agbaghị ọgwụ mgbochi arụrụbara bido n'afọ 2010 rue afọ 2017 nke mere ka ọrịa ahụ jalite ọzọ n'ụwa niile. Ihe karịrị nsogbu arụrụbara ọhhụụ bụ ihe mere n'ụwa niile n'ọwa atọ mbụ n'afọ 2019. Nwaanyịm mụrụ ejima n'ụlọmkpọọ anwụọla Ụmụ Igbo ụnụ echetara nwaayị mụrụ ejima n'ụlọmkpọrọ Afokan dị na Calabar n'izu gara aga? Akụkọ na-eru anyị nti kwuru na nwaanyị ahụ onye na-eche ikpe maka ebubo izu nwa( dị ime ọnwa isi n'ọnwa Novermber afọ 2018) alaa la mụọ abalị abụọ ọ mụchara nwa n'ihi nsogbu so ọwụwa afọ a waara ya maka ịmụ ụmụaka ndị ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọmkpọrọ ahụ bụ ASP Effanga Etim,kwuru na ha nyere ya ezi nleta dịka e debanyere aha ya n'ụlọgwụ 'General Hospital in Calabar' maka nleta tupu a mụọ nwa ma bugakwa ya nnukwu ụlọọgwụ 'University of Calabar Teaching Hospital' (UCTH) oge ọnọdụ ya kawanyere njọ. N'egwuregwu Man City egosila Man. U nkarị Bernardo Silva kpara ike n'asọmpị ndị Man City na Manu U karịcha ndị egwu ndị ọzọ dịka o nyere goolu nke 14 ya n'agba a Manchester City kụrụ Manchester United isi aba okpu dịka ha nyere ha ọkpụ abụọ asataghị ihe n' asompi ha nwere na Old Trafford n'abalị Wenezde. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-49233267,https://www.bbc.com/igbo/afirika-49233267,El-Zakzaky Release: Anyị ga-erube isi n'ihe ụlọikpe kpebiri - DSS,Akụkọ dị mkpa taa,"Sheikh Ibrahim Zakzaky Ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Services' (DSS) ekwuola na ha ga-erube isi na mkpebi nke ụlọikpe nyere gbasara Ibrahim El-Zakzaky. El-Zakzaky bụ onye isi ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) nke gọọmentị Naijiria kpọchiri ya na nwunye ya Zeenat kemgbe afọ 2015. Mana ụlọikpe ukwu dị na Kaduna nọrọ n'ụbọchị Monde nye iwu ka a tọhapụ ha nwa mgbe nta ka ha gaa ụlọọgwụ dị na mba India maka okwu ahụike. Ha nyekwara iwu ka ụfọdụ ndị gọọmentị soro ya gaa n'ụlọọgwụ, iji hụ na ọ ga-alọtakwa mgbe ọ natachara ọgwụgwọ. Ndị uweojii kwụchiri ebe e si aga ụlọikpe ebe a nọrọ kpee El-Zakzaky ikpe N'akwụkwọ ozi ya, Peter Afunanya, bụ ọnụ na-ekwuru ndị DSS n'Abuja kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-akparịta ụka maka ịtọhapụ El-Zakzaky. O kwuru sị, ""Anyị anatala akwụkwọ iwu nke kwuru ka anyị tọhapụ El-Zakzaky. ""Anyị ga-agba mbọ irube isi n'ihi na anyị bụ ụlọọrụ na-asọpụrụ iwu."" Ndị otu IMN ewepụtalarị ozi ekele na ọṅụ iji kelee ndị niile gbara mbọ maka ntọhapụ onyeisi ha. Cheta na ndị otu ahụ emeela ọtụtụ ngagharịiwe nke ha ji kpọkuo gọọmentị ka ha tọghapụ El-Zakzaky na nwunye ya. Ngagharịiwe ndị ahụ tara ọtụtụ isi ndị mmadụ nke gunyere ndị otu ahụ, otu onye uweojii nakwa otu onye ọrụ ntaakụkọ. Nke a mere ka gọọmentị etiti machie otu IMN dịka otu ndị oyi egwu. Gọọmentị etiti na-ebo El-Zakzaky na ndị otu ya ebubo igbu mmadụ nakwa ibute ọgbaghara n'obodo. Gọọmentị etiti etinyela ọnụ na ngagharịiwe Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu ekwuola na gọọmentị etiti akwadoghi ọkwa ngagharịiwe nke otu a kpọrọ ""Global Coalition for Security & Democracy in Nigeria"" na-ekwu okwu ime taa na gburugburu Naịjiria. O kwuru sị na ndị na-akpọ oku ngagharịiwe a pụta gosi onwe ha. A tọrọla Igwe n'Enugwu steeti, Igwe Sunday Orji na Nwunye ya Ndị ntọ amaburula igwe ndị Obom Agbogugu dị n'obodo Awgụ, n'Enugwu steeti. Dịka Ebere Amaraizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, a tọrọla ya na nwunye ya n'ụzọ Ogbaku dị n'ụzọ e si esi Enugwu aga Pọtakọt. N'ofesi, Connor Betts egbuola nwanne ya Dịka a na-eru uju ebe oji egbe gbagburu mmadụ itoolu n'ụlọahịa dị na Dayton, Ohio dị na mba Amerịka, a chọpụtala na nwanne ya nwaanyị so na ndị ọ gbagburu. Ndị uweojii obodo Dayton kwuru na Connor Betts dị afọ 24, ji naanị ntabianya 30 gbuo mmadụ ole ahụ ma merụọ ihe ruru mmadụ 27 ahụ n'ụlọ nkwari ọ gara. Ndị uweojii kwuru sị na ọ bụrụ na ọ hụrụ ụzọ baa n'ime ebe ahụ, na ndị mmadụ gaara agwụ. N'akụkọ yiri ya, Ndị Amerịka kwuru na ha na-enyocha okwu gbasara mwakpo onye oji egbe gbagburu mmadụ iri abụọ n'El Paso, Texas, dịka okwu oyiegwu. N'egwuregwu, Ọ kwaala ndị na-akwado Manchester United dịka ndị otu ha sepụrụ aka n'ihe gbasara ịzụta Pablo Dybala. Ha na Juventus bụ ebe Dybala na-agba, kwụsịrị ịkpa ka ha kwuru na ha agaghị akwụnwu ego ole ha chọrọ. Mana dịka okwu Dybala na-amịtaghị mkpụrụ, Harry Maguire ebinyela aka n'akwụkwọ isonyere ndị Man Utd. Harry Maguire abụrụla onye Man Utd. Ihe ruru nde paund iri asatọ ka ndị Man Utd mefuru iji hụ na ha zụtara Maguire bụ onye na-agbaburu otu Leicester City. Nke a bụ egọ kachasịnụ a na-akwụ n'isi onye na-agba azụ (defender) kamgbe egwuregwu bọọlụ bidoro. Akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri a ga-amasị gị: Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ" media-47493448,https://www.bbc.com/igbo/media-47493448,Algeria protest: 'Anyị achọghị onyeisiala si mba ọzọ achị anyị' - Ndị mba Algeria,Akụkọ dị mkpa:,"Ndị mba Ọljiria ka na-eme ngagharịiwe ha malitere izu abụọ gara aga, maka ịkwụsị onyeisiala ha chọrọ ịbịaghachị zọọ ọkwa nke ugboro ise. Onyeisiala Abdelaziz Bouteflika dị afọ iri asatọ na ise achịala mba ahụ afọ iri abụọ, n'agbanyeghi na ọ nọ n'ụlọọgwụ dị na mba Swizaland. Aisha Buhari Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari adụọla di ya bụ Muhammadu Buhari na ndị APC ọdụ ka ha họpụta ndị bụ ndị pati ahụ n'ọrụ ọkwa ọchịchị. Aisha kwuru nke a ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ọ kpọrọ iji kelee ndị tụnyere ha vootu n' amaegwuregwu Daura Stadium. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Họpụtanụ naanị ndị APC n'ọrụ ọkwa ọchịchị - Aisha Buhari N'egwuregwu, Ngalaba FIFA agbaala isi akwara jụ na ha agaghị ewepụ mmachi ha machiri Chelsea ịzụ ndị egwuregwu ọhụrụ n'ime afọ abụọ. Ọkụ gbara n'Akwa Ibom Ọ bụ n'obodo Ibesikpo Asutan ka ụlọọrụ Inec ahụ agbara ọkụ dị. Rue ugbua, amabeghi ihe butere ya bụ ọkụ gbara mana onyeisi Inec na steeti ahụ bụ Mike Igini agaala nleta ebe ahụ. O kwuru na ọ bụ iji chọpụta ka ụlọ ahụ si gbaa ọkụ rue nakwa ịmata ma akụrụngwa ntuliaka e so n'ihe ndị gbara ọkụ. A gaghị agụnye vootu ndị ejighị 'card reader' tụọ - Inec Inec ekwuola na ha agaghị enye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị manyere ndị ọrụ ha ka a kpọpụta ha dịka ndị meriri na ntuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti a ga-eme ụbọchị Satọde akwụkwọ mmerị. Inec kwukwara na ha ga akagbu ntuliaka n'ebe niile ndị mmadụ jụrụ igwe 'card reader'. Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ngalaba ndị ọrụ ntuliaka metụtara n'ọkwu gbasara nchekwa na ntuliaka n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja. Ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị Dịka a na-eme ncheta ụmụnwaanyị taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Maach, otu United Nations akpọọla oku ka e jiri nka were mee isi a hụrụ kwaba okpu na mbọ ime ka ụmụnwaanyị nweta oke rụrụ ha na ndụ. Nwoke gburu enyi ya Ndị Uweojii nọ na Legọs anwụchiela nwoke asụgburu enyi ya n'ihi ndọrịtaụka onye elekereaka ya ka dị oke ọnụ ahia n'Ikorodu dị na Legọs na nso nso. Onụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Oti kwuru na ha na-eenyọcha nwoke ahụ e kwuru na ya na ya enyi ya nwụrụ anwụ bụ ndị otu nzuzo a kpọrọ 'Eiye Confraternity'. Onye ihe Manchester United na-amasị N'egwuregwu, a sụrụ otu onye ihe otu egwu bọọlụ Manchester United na-amasị mma na Paris, mba France dịka otu bọọlụ ahụ merichara PSG ụbọchị Wenezde. Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: International Women's Day: 'Agaghị m ata onwe m ụta na m bụ nne na-arụ orụ- Ngozi Nwobia" afirika-46465176,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46465176,N800b subsidy debt: Gọọmentị ejigbuola anyị n'ụgwọ - Ndị ahịa mmanụ,Akụkọ dị mkpa,"Ndị ahịa mmanụ ụgbọala na Gọọmentị Ndị na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na onweghi nkwerikọta ọbụla ha na gọọmentị nwere banyere ụgwọ ego dị ijeri narị naịra asatọ e ji ha. Onye odeakwụkwọ ha bụ Olufemi Adewole kwuru na ha ka kwụ ebe ha kwụ bụ ịkwụsị ọrụ dịka ụbọchị asaa ha nyere gọọmentị na-abịa n'ozuzu. Mbaka arịọla Peter Obi Soshial Midia na-enwu ọkụ n'okwu banyere arịrịo Fada Ejike rịọrọ Peter Obi n'okwu ọ gwara ya n'ịzuụka gara aga. Ọtụtụ kwuru na Mbaka e gosila ihe o ji bụrụ ezigbo nwa Chineke ebe ndị ọzị na-ekwu na okwu ya bụ ihe ihere nye ụka Katọlik. N'ofesi Osote mịnịsta ọdịnala na mba Fransị bụ Laurent Nunez ekwuola na ihe ruru mmadụ puku iri atọ na otu esonyela na ndị ye akwa odo odo na-eme nghagharị iwe na mba ahụ. Ngagharị iwe a nke bụ maka mbuli ọnụ mmanụ ụgbọala ka na aga n'ihu n'agbanyeghi na gọọmentị mba Fransị akwụsịtụla ya rue ọnwa isii. N'egwuregwu Mohamed Salah nyerela Liverpool goolu 44 n'afọ 2017/2018 Mohamed Salah na-enwu ọkụ dịka ọ bụ ya kachasị e nye goolu n'asompi dị na mba Yurope kamgbe otu afọ ma a gụpụ Lionel Messi. Salah nyere goolu atọ na mmeri Liverpool ji ọkpụ goolu anọ merie Bournamouth n'asọmpi Premier lig. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Body Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada Ọkụ abaala ụlọahịa na Kaduna Ọkụ ataala ọtụtụ ụlọ ahịa a na-ere redio, TV na ngawa ahịa ""electronic"" ọzọ n'ụzọ Ahmadu Bello Way dị na Kaduna, isi obodo Kaduna steeti. A na-eche na ọkụ a bidoro n'otu ụlọ ahịa n'elekere iri nke abalị Fraịde, ree ọtụtụ ụlọahịa. Ahmadu Bello Way bụ ebe ọtụtụ ụlọahịa dị na Kaduna. Ndị ọrụ gbata gbata na Kaduna dere n'akara Facebook ha na ha gaara ebe a ọku a gbara ịgbanyụ yainye. Opec enwela nkwekọrịta nchabi mmanụ agbịdị Opec, bụ ọgbakọ mba ndị na-emepụta mmanụ, achabiela oke mmanụ ha ga na-emepụta. Mba iri ọzọ na-emepụta mmanụ na-anọghi n'otu ahụ so nwe nkwekọrịta na a ga-achabi mmepụta agbọ mmanụ otude na narị ise kwa ụbọchị. Ebumnobi ha bụ na ọ ga-eme ka ego a na-ere mmanụ belata ọdịda ọ na-ada. Azọgbuola mmadụ isii na Itali Ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ azọgbuola mmadụ isii n'ebe a na akwọrị akụ n'obodo Ancona dị n'Itali. Ebe mmadụ otu narị ọzọ merụrụ ahụ, nke mmadụ iri n'ime ha merụru ezigbote ahụ. Mberede a mere ka awaụru ose ebe ndi a nọ. N'egwuregwu, Taa ka ndị Super Falcons ga-amata ndị ha na ha ga ezute n'asọmpị Iko Mbaụwa nke ụmụnwanyị a ga-agba n'afọ 2019. Falcons ritere ohere ịga iko Mbaụwa a ka ha turu ugo n'iko mba Afrịka nke ụmụwanyị a gbara n'Accra, isi obodo Ghana. Gee akụkọ ndị a n'ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47877200,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47877200,Anambra state agaghị akwazi ozu karịa otu ụbọchị,Akụkọ dị mkpa,"Ụlọomeiwu Anambra Steeti emeela iwu ga-amachi itufu oke ego n'akwamozu onye nwụrụ anwụ bụ nke ha kpọrọ ""iwu eji ejikwa mmemme ili na akwamozu mmadụ na steeti"" Ụlọomeiwu a kwuru na ọ bụ ịda iwu ma ọ bụrụ na e mee mmemme akwamozu onye nwụrụ anwụ karịa otu ụbọchị. Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ Onye tụnyere atụmatụ iwu a bụ Charles Ezeani, na-anọchite anya Anaocha II n'ụlọomeiwu Anambra Steeti. Iwu a kwukwara na agaghị e dosa ozu mmadụ n'ụlọ ozu karịa ọnwa abụọ onye ahụ nwụrụ, ebe emume akwamozu agaghị akarị otu ụbọchị. N'ajụjụ BBC Igbo gbara Pete Ibida na-anọchite anya Njikoka 2, o kwuru na ha na-eche ka gọvanọ Willie Obiano tinye aka n'akwụkwọ ga-eme ya iwu. Ọkaikpe agbahapụla ikpe Okorocha Ọkaikpe Taiwo Taiwo ji ikpe Gọvanọ Rochas Okorocha na ụlọọrụ Inec akwọchapụla aka n'ikpe ahụ. O kwuru na ikike ya erughi ichabi ikpe n'akwụkwọ Okorocha gbara ụlọọrụ Inec maka ịkpachi asambodo ya n'ihi akwụkwọ onye ji aha PDP zọọ ọkwa ahụ bụ Jones Onyereri gbara ya. Uweojii nwụchiri ndị ntọrị abụọ Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti Ndị uweojii Legọs Steeti kwuru na aka ha akparala mmadụ abụọ a na-enyo so na ndị tọọrọ onyeisi ụlọọrụ ndị mgbanyụ ọkụ bụ 'Fire Service' na Legọs. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Bala Elkana kwuru na mmadụ abụọ anwụchiri n'abalị asatọ nke ọnwa Epụrelu afọ 2019 na-enyere ha aka ịchọpụta ndị otu ha. N'ofesi Na mba Taiwan, onye dọkịnta fopụtara aṅụ dị ndụ anọ febara ma biri n'ime anya otu nwaanyị a kpọrọ He, oge ọ nọ na-abọcha ahịhịa dị n'akụkụ ili. N'egwuregwu Ugo ga-ebere na mgbagbu n'abalịa dịka Manchester United ga-anabata Barcelona n'asọmpi Uefa Champịọns Lig. Ebe Ajax Amsterdam ga-elekwa Juventus ọbịa. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Benjamin Netanyahu Ntuliaka Izrel dịka ọ na-agba nhatanha Ntuliaka iji họpụta aka ga-achị mba Izrel kpụ ezigbote ọkụ n'ọnụ ugbua dịka amaghị onye ga-atụ ugo n'etiti pati Likud nke Benjamin Netanyahu nakwa pati ""Blue and White"" chọrọ ichutu ha n'ọkwa. Patị abụọ a na-ele anya ịnwete ọkwa iri atọ n'ise n'ụlo ọmeiwu nke Izrel. O nwekwara ndị Igbo sonyere binye aka na Izrel: Nke pụtara na-amabeghị pati ga-akpọkọ pati ndị ga-abụ na-ahazi gọọmentị. Buhari alọtala Onyeisiala Muhammadu Buhari atuola ụkwụ na Naịjirịa site na njem omere gaa mba United Arab Emirates. Ọkọtọ na-eche ya metụtara oke mwakpo na-eme mpaghara dị iche iche na Naịjirịa, okachị nke metụtara ogbugbu mmadụ, ntọrị mmadụ na mwakpo Boko Haram. Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị Boko Haram Ndị agha Naịjirịa na-akọwa na ha meminariri ndị omekome Boko Haram chọro ịwakpọ isi obodo Yobe steeti bụ Damaturu. Ndị agha sị na ha gburu ọtụtụ ndị agha Boko Haram ma nye ha ọzọ ka ha tinyere isi ịba obodo ahụ. N'egwuregwu Asọmpị Champions league nwurulu ọkụ ụnyaahụ ka Tottengham bụ agada gbachiri ụzọ Man City ka ha ji ọkpụ goolu asataghị sị ha ""chere, anyị na-abịa"" . Ọnụ otu egwuregwu Liverpool bụ sọ ọchị n'Anfield ebe ha ji goolu abụọ enweghị asisa mechie Porto ọnụ. Gee nkeji a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa: Dance: Ọ na-afụfụ n'ahụ mana ọ na-enye m ọṅụ - Dr Onye mme mme" afirika-46916029,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46916029,Lai Mohammed: Atiku ga-aza azịza maka ebubo na aka ya dị n' ọdịda ụlọakụ PHB,Akụkọ dị mkpa taa,"Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Naijiria bụ Lai Mohammed ekwuola na Atiku Abubakar bata mba Amerika ebe ọ gara njem, na o nwere ajụjụ ọ ga-asa gọọmenti maka ebubo na aka ya dị na ọdịda ụlọakụ PHB. Mohammed kwuru na gọọmenti etiti na-enyocha 'akwụkwọ gosiri na o nwetara otu nari nde naira na iri ise na isii (N156 million)."" N'okwu ala Amerịka Atiku gara, o kwuru na o nwere ohere ịnọ ebe ahụ oge ole masịrị ya mana ọ lọta, ọ bịa zara ọnụ ya. Ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ n'okwu ahụ Laị Mohammed kwuru. Onye e ji okwu ya agba izu n'otu pati PDP nke steeti Imo bụ Maazi Ndụbụisi Williams, tiri obewu na nkata a gọọmenti etiti na-akpa pụtara ""ịchụgharị onye na-enweghị ihe o mere."" Ọ gakwara n'ihu ma dụọ gọọmenti etiti ọdụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe, ma kagbuo atụmatụ ahụ nke o kwuru nwere ike iwetara ntụliaka ọnwa Febụwarị ihe mkpọbi ụkwụ. Ụmụ Naijiria nọ n'igwe okwu Twitter na-ekwukwa nke ha banyere ihe Lai Mohammed kwuru. @john_danfulani kwuru na ọ masị gọọmenti etiti ha tinye Atiku na mkpọrọ na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara ịtụnyere ya vootu. @KeehNee kwuru na okwu Lai Mohammed na-egosi na gọọmenti nọ n'ọchịchị chọrọ ijidesi ọkwa ike n'ụzọ abụla ụzọ. Ụlọikpe atọhapụla Sinetọ Dino Melaye onye ndị uweojii ji kemgbe izuụka abụọ o jiri nyefe onwe n'ebubo na ọ chọrọ igbu mmadụ. BBC Igbo hiwere nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti na Fraide N'akụkọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị, BBC Igbo ga-eme emume nrụrịta ụka nke ndi na-azọ ọkwa govanọ n'Imo steeti taa. Ndị adọrịta ụka taa bụ Hope Uzodinma, Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Emeka Ihedioha. Ọ ga-amalite n'elekere abuọ nke ehihe. Ọzọ, Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru otu PDP nọ n'Amerịka ugbua. Njem Atiku a bụ mbụ ọ ga-aga Amerịka kemgbe ihe ruru afọ iri n'abụọ. Ọ sị na ọ ga-eji ohere a leta ndị ọrụ gọọmentị Amerika nakwa ụmụ Naijiria bi mba ahụ Gụọ ya n'uju ebe a Na ofesi, Ọgbakọ mba Afrịka bụ African Union arịọla ka mba Kongo DRC dọtịa aka mgbe ha ga-akpọpụta aha onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala ha mere. Ọnụogugu nke ngalaba na-ahazị ntuliaka na mba ahụ weputara na-egosi na Felix Tshisekedi meriri mana onye ọzọ aha bụ Martin Fayulu na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri. N'egwuregwu, Ndị Super Falcons nke NaỊjirịa natara ọkpụ goolu atọ na-asataghị otu n'aka otu egwuregwu bọọlụ umunwaanyị nke China n'asọmpị enyi n enyi ha gbara n'ụbọchị tọọsde na Romania. Falcons ga-ezute Romania na-agba a ga-eji mara onye ga-abụ onye nke atọ na asọmpị a. Akụkọ BBC na Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Ajụjụ ụmụ Igbo chọrọ ka a jụọ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ" afirika-51640136,https://www.bbc.com/igbo/afirika-51640136,Ash Wednesday: 'Iyi akwa ojii nara ntụ bụ ozi anyị na-ezigara onyeisiala maka enweghị ezi nchekwa ' - Bishop Martins,"Ekwe kụọ, ama agbaa!",Nwanne kedụ ka ị si akwado ịnara ntụ taa? Tupu ị gawa ụka taa bịa gere ihe Archibishop ụka Katọlịk nke Legos bụ Adewale Martins kọwara maka etu ndị ụka katolik niile ga-esi yiri akwa ojii nara ntụ. O kwuru ka ụjọ ghara ịtụ onye ọbụla ma ọ bụrụ na a majaa ha makana ya na ndị Catholic Bishop Conference of Nigeria kwụ ha n'azụ. Ndị mere ihe nkiri a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Nnamdi Agbanelo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: afirika-46341124,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46341124,Buhari: Ọnọdụ ndị uweojii Naịjirịa agbanwela,Akụkọ dị mkpa:,"Onyeisiala Muhammadu Buhari ewepụtala ụgwọ ọnwa ọhurụ a ga-anakwụ ndị uweojii Naịjirịa. Buhari kwuru na ọchịchị ya ga-eme ihe niile ịhụ n'ihe ọbụla gbasara ndị uweojii ọkachasị ihe ha ji enyere ndụ aka ga-adị n'uju ka ugwu ha furu efu diri ha. O kwuru mgbe ndị otu ""Nigeria Police Service Commission"" gara ikela ya n'Abuja. Ha gara ikele ya maka etu o siri kweta ka e bulie ego ụgwọ ọnwa ha nakwa ego ezumike nka ha. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka etu e si agbasa ozi na Naịjirịa bụ NBC n'aha ichafụ enyela ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndụmọdụ ka ha gbara okwu akpọmasị ọsọ. NBC kwukwara ka ha gbara agwa ọbụla ga-eme ka ntuliaka na-abịa n'afọ 2019 ghara ịga nkeọma. Ọ bụ onyeisi ha bụ Mallam Ikra Bilbis, nyere ndụmọdụ a n'ọgbakọ ha mere na Sokoto n'ụbọchị November 26, 2018. Ụmụnne Ojukwu na nwunye ya gara ụlọikpe maka akụnaụba nna ha N'icheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndorondọrọ ọchịchị ugbua na-eme. Cheta na a na-eme ncheta ọnwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dịka ọ gbara afọ asatọ. Ndị otu Ipob kwuru na ndị uweojii na-atụ asị Ndị uweojii ewepụtala aha mmadụ iri atọ na atọ ndị ha na-ebo ebubo na ha gburu otu onye otu ha n'ọgbaghara mere na Nnewi. Ha kwukwara na ndị Ipob merụrụ ""onyeisi ndị uweojii (DPO) ogige Central Police Station (CPS), Nnewi bụ CSP Babalola Adewunyi, ASP Micheal Duru nke 'Area Command, Nnewi' nakwa Inspector Akinbami Olaniyi nke CPS Nnewi ahụ. N'egwuregwu Otu Manchester city na united na-eme karị ọzụzụ ka ha wee dị sam maka egwuregwu bọọlụ O nwere ihe di iche n'etiti Man United na Man city? Otu egwuregwu Manchester United na-anata ego ụgwọ ọnwa ji nde pound 500 karịa nke otu Manchester city n'ime otu afọ dịka Global Sports Salaries Survey si kwupụta. N'ofesi Alaọmajiji gburu mmadụ ruru narị isii na Iran n'afọ 2017 Ihe karịrị mmadụ narị asaa emerụọla ahụ n'ala ọma jiji mere n'ọdịda anyanwụ Iran n'abali ụbọchị ọnwa Nọvember 25. E nwebeghi onye e kwuru nwụrụla nụ maọbụ onye merụrụ ahụ. Ihe a mere n'akụkụ ebe ala ọmajiji gburu mmadụ ruru narị isii n'afọ 2017 mere. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri ndị Igbo kwesiri ịga ebe niile - Ken Erics Inec: Bia nara PVC gị Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC ndị dị na mpaghara ọwụwanayanwụ agwala ndị mmadụ ka ha gaa n'okpuru ọchịchị obodo ha ga were akwụkwọ ntụliaka ha bụ PVC na bekee. Ọnụ na-ekwuru ndị INEC n'Imo Steeti bụ Oriakụ Benson kwuru na 'PVC' ndị debara aha site n'afọ 2017 rue n'ọnwa Juun nke afọ 2018 apụtala. O kwuru na nkesa 'PVC' ga-amalite taa n'isi ụlọọrụ ha dị n'okpuru ọchịchị obodo dị iche iche na Steeti ndị dị na mpaghara ọwụwanyanwụ. Mkparịta Gọọmentị na ASUU Gọọmentị na otu jịkọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU ga-enwe mkparịta ụkọ ọzọ taa iji mee ka ha kwụsị abụbọ ọrụ ndị otu a na-agba. Onyeisi ndị ASUU bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị mee ihe ha kwesiri ime na ha ga-akwụsị abụbọ ọrụ a nọrọla izụụka atọ. Ọdịda ọnụego mmanụ Egwu ji ndị ọkachamara n'ihe mgbasara akụnaụba dịka ọnụ mmanụ agbadị dara rue dọla iri ise na asatọ kwa otu udu mmanụ n'ahịa mbaụwa. Cheta na ndị isi ọchịchị bụ Federal Executive Council na bekee gbadoro ụkwụ na ọnụ mmanụ ịda dọla iri isii wee hiwe mkpata na mmefu nke afọ a. Naịjirịa kwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị - Moghalu N'ofesi Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May agwala ndị ọmeiwu ha na ọ bụrụ ha gbahapụ nkwerikọta 'Brexit' na ọ ga-ebute nkewa na adịghị n'otu. Okwu ya na-abịa dịka ndị ndu mba ndị nọ na European Union tinyechara aka n'akwụkwọ nkwekọrịta maka 'Brexit'. N'egwuregwu Onye na-agbara Super Falcons bọọlụ Asisat Oshoala ekwuola na ọnọdụ ọma ha nọ n'asọmpi Iko mba Afrịka abụghị ọrụ otu onye kama ọ bụ mammịrị anyụkọtara ọnụ. Oshoala nyere goolụ atọ na mmeri ha ji ọkpụ isii merie ndị Equitorial Guinea iji baa agba abụọ nke ikpeazụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Ihe nkiri ndị Igbo kwesiri ịga ebe niile - Ken Erics" media-47594563,https://www.bbc.com/igbo/media-47594563,Building collapse in Lagos: Aisha Buhari gara ileta ndị ụlọ dakwasịrị,Akụkọ dị mkpa:,"Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari agaala ileta ndị merụrụ ahụ ka ụlọelu dara ma gbuo ndị mmadụ na Legọs, ụbọchị ole na ole gara aga. End of Twitter post, 1 O kperela ndị ọdachi a dakwasịrị ekpere. Aisha kwuru sị na obi dị ya ụtọ ịhụ ka ndị ihe mere na-agbake, ma kelekwaa gọọmentị Legọs steeti maka ịgbata ọsọ enyemaka. Cheta na ụlọelu ahụ dagidere ma ụmụakwụkwọ ma ndị na-ere ihe n'okpuru ya. Ntuliaka Rivas tara isi ọkammụta Ọnwụ Ferry Gberegbe bụ ihe ihe ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua, dịka Gọvanọ Nyesom Wike gara mgbaru n'ụlọ ya. Gọvanọ Nyesom Wike gara mgbaru n'ụlọ Gberegbe Gberegbe rụrụ ọrụ dịka onye nnọchiteanya PDP n'okpuru ọchịchị Khana oge e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ na Rivas steeti, hụrụ ọnwụ ya n'anya ka ọ gara ịrụ ọrụ e dinyere ya. Site n'ihe onyonyo na-agagharị na soshal midia, egbe otu onye uweojii gbapụrụ, tụrụ Gberegbe bụ onye nkuzi na Rivers Poly dị na Bori n'afọ, mere ka e buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ lakwuru chi ya. N'akwụkwọ ozi si n'ụlọọrụ gọọmentị Rivas steeti, Gọvanọ Wike kwere nkwa ilekọta ezinaụlọ ya ka ọ gara mgbaru na be ya, ma kwuo na ọ ga-enye ha nde naịra abụọ (N2m) ka e ji zụọ ụmụ anọ Gberegbe hapụrụ, n'agụmakwụkwọ. Wike kwekwara nkwa iwuru ha ụlọ ma tinyekwa aka n'akwamozu ya. Uche Secondus bụ onyeisioche PDP, dugara Wike mgbaru a, ma kwuo na ihe a tara isi Gberegbe, bụ makana ""ndị uweojii na ndị agha abụrụla ndị ndọrọndọrọ ma bụrụkwa ndị na-arụ ihe ndị ndọrọndọro ziri ha"". Ka BBC kpọtụrụ Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivas steeti, o kwuru na ha na-elebanye anya n'ihe niile gbasara ọgbaghara/ọgụ na mgba dapụtara na ntuliaka a. Ndị mmadụ anwụọla n'IDP camp, Dịka otu Norwegian Refugee Council si kwuo, mmadụ asatọ anwụọla ebe ihe ruru mmadụ puku iri na ise enweghizi ebe obibi dịka ọkụ nwatakịrị ji esi nri gbasara ma mụnye ọkụ n'ebe ndị gbara ọsọndụ na-anọ n'obodo Gajiram dị na Bọrọnu steeti. N'akụkọ si mba ọzo, Ajọ ifufe egbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ebe ihe ruru mmadụ iri anọ ka na-efu, na mba Zimbabwe. Ajọ ifufe a akpọro Idai, malitere na mba Mozambique na mgbede Tọọzde gara aga, tupu ọ banye Zimbabwe ebe ọ na-ebu ma ụlọ, akwammiri nakwa okporoụzọ. N'egwuregwu, Otu egwu basketbọọlụ ụmụnwaanyị Naịjiria ga-ezute Rọshịa, Ajentina na Koriya, n'asọmpi iko mbaụwa ga-amalite n'ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọst, na mba Chaịna. Gbenga Daniel agbaala ndọrọndọrọ ọchịchị ""arụkwaghịm"", Gbenga Daniela chịburu Ogun steeti ma bụrụkwa onyeisi ngalaba nhazi achụmnta vootu Atiku Abubakar na ntuliaka 2019, ekwuola na ọ ga-awụsa ọwa n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị. Gbenga Daniel chịrị Ogun steeti afọ asatọ, site n'afọ 2003 ruo afọ 2011 N'akwụkwọ ozi o kesara nke BBC nwetara, o kwuru site na bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị, na ọ chọrọ igbado anya n'ọrụ ndị ọzọ na-abụghị ndọrondọro ọchịchị. O kwuru na ọ chọrọ ikpọlite ngalaba o hibere maka nlekọta ndị mmadụ anya n'efu nke ọ kpọrọ ""Gateway Front Foundation (GFF)"", na ndụ. Ndịagha so gbosaa ntuliaka Rivas steeti 'Komiti Inec hiwere ilebanye anya n'ọgbaghara so ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas steeti ewepụtala ozi ihe ha chopụtara were kwuo na ndị agha Naijiria na ndị agboro bụ ndị wakporo ebe a na-achịkọta mpụtara ntuliaka,majaa ndị ọrụ Inec ma gbosaa ọrụ ha. Inec kwuru na ndịagha Naijiria so gbosaa ntuliaka e mere na Rivas steeti Onyeisi gbasa ozi Inec bụ Festus Okoye kwuru n'ozi o wepụtara na Fraide na komiti ahụ chọpụtara na e mela ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti n' ọtụtụ n'ime ọdọ atụmvootu ma kpọpụta mpụtara ha tupu a kwụsị ihe niile gbasara ntuliaka na steeti ahụ. Cheta na Inec kwụsịburu nchịkọta na mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu e mere na Rivas n'abali 10 nke ọnwa Maachi n'ihi akụkọ tigbu-zọgbuo, so ya bụ ntuliaka. Okwui Enwezor efereela ụwa a aka Okwui Enwezor, onye bụbu onyeisi, Haus Der Kunst, bụ ulọ nchekwa nka na mba Germany Nwafọ Igbo bụ ọkaibe na idokwa ihe nka ama ama na mbauwa bụ Okwui Enwezor ,onye Awkuzu, Anambara steeti anwụọla ụbọchị Fraide na mba Germany ka ọ rịachara ọrịa kansa afọ ole na ole. Enwezor onye gbara afọ iri ise na ise tupu ọ nwụọ bụbu onyeisi Haus Der Kunst bụ ulọ nchekwa nka na mba Germany. Ụlọelu ọzọ adaala n'Ibadan,Oyo steeti Ụlọelu dara n' Ibadan Ụlọelu nwere ogogo atọ a na-arụ arụ adala dagide dị na-arụ ọrụ na ya na Molete, Ibadan, Oyo steeti ụbọchị Fraide. Nke a na-eme abali abụọ ụlọelu dachara na Legọs gbuo mmadụ iri abụọ ma merụọ ọtụtụ ahụ. Ka ọ dị ugbua, a zọpụtala mmadụ asaa n'ime ndị ụlọ ahụ dagidere dịka ndị nọ ebe ihe mere siri kwuo. New Zealand Shootings: Aka akparala Brenton Tarrant A kpụpụrụ Brenton Tarrant, onye dị afọ 28, ụlọikpe ụbọchị Satode maka mwakpo a wakporo ụlọụka Alakụba abụọ na Nu Ziland A kpụpụla Brenton Tarrant, onye a na-enyo enyo dika isi a hụrụ kwaba okpu na ihe ọdachi ịgbagbu mmadụ iri anọ na itoolu nke mere n'ụlọụka Alakuba abụọ na mba Nu Ziland ụlọikpe Akụkọ na-ekwu na mmadụ iri atọ na itoolu ndị merụrụ ahụ ka na-anata nleta n'ụlọọgwụ. Fifa ga-amalite asompi Klọb mbaụwa n'afọ 2021 Fifa akwadola ka e nwee asọmpi otu egwuregwu iri abụọ na anọ nke ga-ebido ọnwa Juun, afọ 2021 n'agbanyeghị na Europrean league ekwuola na ha agaghị esonye n'asọmpi ahụ. Gee akụkọ ndị a n'ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-48891959,https://www.bbc.com/igbo/afirika-48891959,Pastor Adeboye: Gbaara njọ anụahụ ọsọ - Adeboye,Akụkọ dị mkpa:,"Gbanarị njọ nke anụahụ - Adeboye Onyeisi ụlọụka Redeem bụ Enoch Adeboye adọọla ndị ụkọchukwu ibe ya aka na ntị ka rie mbọmbọ ọsọ n'ihụ ọnwụnwa ọbụla metụtara njọ anụahụ. Adeboye gara n'ihu kwuo na onweghi njọ ọbụla zoro ezo n'okpuru anyanwụ, na agaghị apụta ihe nwa mgbe nta. Anambra na Rivers enweteela Kọmishịọna ndị uweojii ọhụrụ Ndị Anambra na River Steeti enwetela kọmịshịọna ndị uweojii ọhụrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba si kwuo n'ụbọchị Fraịde. Abang John bụ zi kọmịshịona uweojii n'Anambra Steeti ebe DanDaura Mustapha bụbu nke Anambra bụzị Kọmishịọna Uweojii nke River Steeti ugbua. Na Botswana Gọọmentị mba Botswana ekwuola na ha ga-aga n'ụlọikpe mkpegharị gaa ma aka n'ihu banyere ikpe nyere ikike ka nwoke na nwoke , nwaanyị na nwaanyị nwe mmekọrịta. Ọkaiwu ukwu nke gọọmentị mba ahụ bụ Abraham Keetshade kwuru na ndị ọkaikpe kpere ikpe ahụ jehiere ejehie. N'egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa ezila ndị Indomitable Lions nke Kameroon ihe ọkụ ji ntị oke e me site n'iji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi Iko Afrịca. Kameroon gbara mbọ ha niile mana Naịjirịa kwechiri ka ajọ ọnwụ rue mgbe asọmpi a gwụrụ. Nkeji: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile PDP sị Elumelu na ndi ọzọ ga zutu ike n'ihe banyere pati ha Omeiwu Ndụdị Elumelu sị na ogbagwojuru ya anya etu pati ya bụ Peoples Democratic Party (PDP) jii mee ngwangnwa si ka ya na mmadụ asaa ọzọ ga zuo ike nwa mgbe nta. Elumelu bụ onye na-anọchite anya Aniocha/Oshimili n'Ụlọ Omeiwu nke obele bụ onye aka na-achị Ụlọ omeiwu bụ Femi Gbajabịamila hopụtara dịka onyeisi pati akachasị. PDP n'osi ha zịgara Gbajabiamila kwuburu na ọ bụ Kingsley Chinda ka ha chọrọ na ha bụ oche. Gbajabiamila gbajọrọ ihe PDP kwuru wee họpụta Elumelu na Toby Okechukwu ga-abu osote ya. Ọnu na-kwuru PDP bụ Kola Ologbondiyan kwuru ụnyaahu na Toby Okechukwu, Wole Oke, Lynda Ikpeazu, Anayo Edwin, Gideon Gwani na Adekoya Abdul-Majid ga enyegodi pati ha ohere ugbua. Buhari na-agba mba Naịja A na-ele anya na Buhari ga-alọta ozigbo emechara nzụkọ ahụ Onyeisiala Muhammadụ Buhari ga-aga mba Nije taata dịka nzukọ otu mba Afịrịka n'isi obodo mba ahụ bụ Naimey. A na-atụ anya na Buhari ga-ebinye aka n'atụmatụ ga-ewezụga mgbochi na mbere akọpọrọ Africa Free Trade agreement na Bekee dịka ọ nabatara mkpebi ndị gbara izu maka ya. N'ofesi Ala ka na-amakwa jijiji na mpaghara California dị na mba Amerịka. Ndị na-agbakọ ala ọma jiji sị na nke mere taata ka nke mere nwanne ụnyaahụ ma bụrụ nke kachasị sie ike n'ime afọ iri abụọ Senegal agafela agba nke atọ N'egwuregwu, Senegal ji otu okpu asataghị chụpụ Uganda n'asọmpi Iko Mba Afịrịka ha gbara ụnyaahụ. Taata, Nigeria na Kameroon nakwa Ijipt na South Afịrịka bụ ndị ga asụ mpị iji mara ndị ga-agafe agba nke atọ. Gee nkeji ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee Ihe nkiri anyi nke taa Omega Power Ministry: 'Ndị ọzụzụ atụrụ ekwesịghị iri atụrụ etinyere ha n'aka' - Apostle Chinyere" afirika-47783746,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47783746,2019 Election: Anyị ga-enwe mmejupụta ntụliaka ọzọ na Rivas - INEC,Akụkọ dị mkpa,"INEC na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka ntuliaka nke 2019 ga n'ụzọ ziri ezi Ụlọọrụ INEC ekwupụtala na a ga-enwe mmejupụta ntụliaka ọzọ n'ụfọdụ ebe dị icheiche n'ụbọchị Satọde, abalị iri na atọ ọnwa Eprel, 2019 maka ọkwa gọvanọ nke steeti Rivas. N'ozi ha zipụtara n'igwe mgbasa ozi Twitter ha, INEC kwuru na nke a so n'usoro mpụtara nke ụlọọrụ a wepụtara mgbe ha tụlechara ka e si mee ntụliaka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ. Ọ gaziri n'ihu ma gosipụta afọ ojuju ya n'usoro bụ ịgba ndị ma nke ekwe n'akụ jiri sonye iji mee ka enwee ntụliaka gara nke ọma. Ka osila dị, ụlọọrụ a nọọrọ n'ụbọchị Wenezde, abalị atọ ọnwa Eprel, 2019, ma kpọpụta aka na-achị steeti Rivas bụ Nyesom Wike dịka onye nwetara mmeri na ntụliaka ọkwa gọvanọ nke steeti ahụ. N'otu aka ahụ, ụlọọrụ a kwukwara na ha lebara anya ka ntụliaka nke Sineti nke ọgbọ nta vootu Imo North siri gaa, bụ nke e mere n'abalị iri abụọ na atọ, ọnwa Febụwarị, nakwa abalị itolu nke ọnwa Maachị. Ọ rụtụrụ aka na-ahụtara ụfọdụ ihe ndị koro achịcha na ya, bụ nke mere ojiri hiwe otu kọmiti ga-eleba ya anya. Kpọpụta Rita Orji dịka onye meriri - Ọkaikpe Ọkaikpe Bello Kawu nke ụlọikpe nọ n'Abuja agwala ụlọọrụ Inec ka ha kpọta Rita Orji dịka onye meriri na ntuliaka ịnọchite anya mpaghara Ajero-Ifelodun Lagos n'ụlọomeiwu nta. Rita Orji bụ nwada Igbo banyere n' oche ahụ n'afọ 2015, ma zọọ ọkwa ahụ ọzọ na ntuliaka 2019. Aka akparala ndị gburu Fada Clement Ugwu Ụbọchi niile bụ nke onye ohi mana otu ụbọchị bụ nke onye nwe ụlọ Mmadụ abụọ so n'ime ndị a na-enyo enyo tọọrọ ma gbuo ụkọchukwu Katọlịk bụ Fada Clement Ugwu amaala n'ọnya ndị uweojii Enugwu Steeti dịka ndị uweojii Enugwu siri kwuo n'ozi ha wepụtara. N'ofesi Praịm mịnịsta mba Beljọm bụ Charles Michel na-arịọ mba Burundi, DR Congo na Rwanda n'ihi ihe ọjọọ ha mere n'oge ọchịchị nwa bekee. Ọ rịọrọ mgbaghara maka ị tọrọ ụmụaka ndị mba ahụ nwere agbụrụ abụọ, nke ndị isiọcha na ndị isioji mụkọrọ ọnụ. Ntọrọ a metụtara ụmụaka ruru puku iri abụọ mere n'oge mba Beljọm na-achị mba ndị a. N'egwuregwu NFF akpọbatala Per Harlsson na Matti Demegard dịka ndị ga-eso na-achịkọta Super Falcons na nkwado ha maka asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị nke afọ a. A ga-agba asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2019 na mba Fransị n'ọnwa Juun. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Lee ihe omimi ị maghị maka ọjị Akụkọ dị mkpa nke ụtụtụ Ketil Karlsen bụ onye nnọchiteanya ndị European Union na Naịjirịa na otu ECOWAS, adọọla aka na ntị sị na Naịjirịa ka bụ ebe ndị mmadụ na-atụ mgbere akwụna. O kwukwara na Naịjiria so na ndị isi n'ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ, imanye mmadụ ọrụ n'ike nakwa mpụ ndị ọzọ. O kwuru sị na ndị ngalaba EU achọghị ịkwụsị ndị mmadụ ime njem mbịarambịara, kama na ihe ha chọrọ bụ ịkwụsị ndị na-eji ya emekpa ndị mmadụ ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere otu EU na Naịjirịa bụ Modestus Chukwulaka bụ onye kwuputara nke a n'ozi o kesara. Karlsen kwuru nke a ka ụgbọelu nke 64 bulatara ndị Naịjirịa gbara ọsọ mbịarambịara, tụrụ ụkwụ na Naịjiria. Mmeri Wike: Ụkpa ekele ka na-arị ibe ya elu maka mmeri Nyesom Wike meriri na ntuliaka Rivas steeti. Atiku Abubakar, Peter Obi, Ifeanyi Okowa, nakwa Ben Murray-Bruce na-eto Wike maka ihe ha kpọrọ 'imeri ndị na-agba ọchịchị onyekwuoucheya mgba okpuru.' Ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa na ha agbake - IMF Ngalaba na-ahụ maka akụnaụba na mbaụwa bụ International Monetary Fund, kwuru nke a ka ha na-akụpụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari aka n'atụmatụ ikwalite akụnaụba obodo ọ na-atụpụta. N'ofesi, Ọ dịkwa ka Brenton Tarrant onye a na-enyo maka igbagbu mmadụ iri ise bụ ndị ụka alakụba na mba New Zealand abanyela ofe dị ọkụ. Ndị uweojii mba ahụ ekwuola na ọ ga-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ogbugbu mmadụ iri ise a nakwa mmadụ iri atọ na itoolu ndị ọzọ ọ nwara igbu. N'egwuregwu, Ngwongwo e ji mara Zinedine Zidane kụwasịrị n'abalị, ka o nwetara nzọgbu ya nke mbụ kemgbe ọ malitere ịchịkọta Real Madrid ọzọ. Valencia ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu zọgbuo Madrid, bụ nke ugboro itoolu a na-emeri ha na La Liga n'afọ a. Gere akụkọ ndị ga-amasị gị n'otu nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile" afirika-47068293,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47068293,Wole Soyinka: Agaghị m atụnyere APC maọbụ PDP,Akụkọ dị mkpa:,"Wole Soyinka ajụla Buhari, jụ Atiku Onye na-ede akwụkwọ a mara amara bụ Wole Soyinka ajụla Buhari na Atiku maka ọkwa onyeisiala na na ntuliaka 2019. Soyinka ,onye kwuru nke a n'ọgbakọ e 'Citizen forum' emere na Legọs ụbọchị Tọọzde sị na Naijiria chọrọ ọbara ọhụrụ. ""Oge ụzọ ọhụrụ were anya eruola. Oge onye ahụ pụtara anyị ga-enye ya nkwado."" ""Adịghị ama ama, ka m gwa ụnụ ebe m kwụ ka odo onye ọbụla anya: Mụ bụ Wole Soyinka agaghị atụnyere pati abụọ ahụ na-azọ. Ha abụọ kwesịrị ka a jụ ha kpamkpam."" Transparency International: A ga-ekpoju ndịagha na ntuliaka na-abịa Ndị agha Naịjirịa juru oge e mere ntuliaka gọvanọ n'Osun steeti Ndị ọkachamara n'okwu ikike diri onye ekwuola na ntuliaka e mere n'Ekiti na Osun steeti n'afọ 2018 nakwa okwu Onnoghen na-arụ aka na a ga-eji Ndiagha mee ntuliaka 2019. Otu Transparency International kwuru ụbọchị Tọọzde na obi na-eti ha na a ga-ekpoju ndịagha na ntuliaka na-abịa. Ha kwuru na ntuliaka emerela n'afọ 2018 nakwa ike ndị ndọrọndọrọ ọchịchi ji achụ ka atụnyere ha butere obi otiti ahụ. Na nkọwa ya otu onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Ọkaiwu Ifeanyịi Ulumma gwara BBC na ihe ụfọdụ na-eme na Naijiria ugbua ezuorola ndị mmadụ ịtụ uche na a ga-eji ndị agha mee ntuliaka na-abịa. ""Ọ bụ ihe mere na Osun na Ekiti mere egwu ba ndị mmadụ ahụ na-aga egbojupụta ndịagha."" Ulumma gara n'ihu kwuo na okwu Onnoghen nakwa na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ ọchịagha sokwa azọ ọkwa ọchịchị soro bute egwu ahụ. O kọwara na ọghọm dị n'ikpoju ndị agha na oge ntuliaka bụ na ọ ga-eme ka egwu tụọ ụfọdụ ndị mmadụ mee ka ha ghara ịpụta mee ntuliaka. Ulumma kwuru na dịka e si eme ya n'ofesi, ihe kwesiri bụ naanị ka ndị uweojii soro hụ na udo dị, na enweghị ọgbaghara. A hụla ụgbọala onyeisioche otu pati APC Abia steeti ahụ a tọọrọ Ndị uweojii na steeti Abịa ekwuola na ha enwetala ụgbọala Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche otu pati APC na steeti ahụ a tọọrọ atọrọ. Ọnu na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Geoffery Ogbonna kọwara na ha hụrụ ụgbọala a n'okporo ụzọ si Osisioma gaa Ibeku. Oshoala abanyela otu egwu bọọlụ Barcelona Ọkaibe na bọọlụ ụmụnwaanyị bụ Asisat Oshola eferela otu egwu bọọlụ Barcelona. Ọ hapụru otu egwu bọọlụ ndị mba Spen. Aboubakar Kamara agaala Yeni Malatyaspor N'aka nke ọzọ, otu Fulham ebinyela otu egwu bọọlụ Yeni Malatyaspor onye egwu ha bụ Aboubakar Kamara rue ọgwụgwụ oge a. Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Atiku Abubakar ga-agbaghara ndị zuru ego Naịjirịa Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru PDP kwuru nke a ụnyaaahụ na ogige mkaparịtaụka akpọrọ ""The Candidates"". Ọ sị na ọ bụ ụzọ ọ ga-esi nata ijeri naira ọkankụ ndị aka ntụtụ mịpụrụ n'akpa Naịjirịa. N'otu aka ahụ, Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ Ikpe banyere nde dọla iri anọ na ọma ahụrụ n'ime ụlọ Orsbone Towers na Legọs ga amalite eche bụ ụbọchị Tọsde, abali mbụ nke ọnwa Febụwarị 2019. Ndị gọọmentị kpụpụrụ n'ihu ọkpaikpe bụ onye bụbụ onyeisi ngalaba National Intelegence Agency bụ Ayodele Oke na ọrịaku ya. Onye ọzọ akpụpụkwara ụlọikpe maka ebubo mpụ bụ onyebụbụ ode akwụkwọ gọọmentị bụ David Babachir Lawal. Juan Guaido chọrọ ka ndị agha chụpụ Maduro Onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchi na Venezuela ekwuola na ndi otu ya na ndị agha Venezuela na-enwe nzukọ maka etu ha ga-eji nye aka napụ Onyeisiala mba ahu bụ Nicholas Maduru ọkwa. Juan Guaido echiele onye ya onyeisiala ma nweta nkwado n'aka mba Amerịka na ụfọdụ mba ndi ọzọ ka ọ nọ na njem ịbụrụ onyeisiala ejighi itu vootu tinye n'ọkwa. Chelsea ji nkata buru goolu Chelsea ji nkata buru goolu unyaahụ ka otu egwuregwu Bournemouth ji okpụ goolu anọ asatagi ma otu gosi ha na-ejighi ọnụ ama onye ka ike. N'Itali, Real Madrid nyụkwara Sevile ịkpakwụ ka ha ji ọkpụ goolu isii a satara otu fụọ ha aka n'isi. Gee nkeji a be a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nke taa:" afirika-46819759,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46819759,Ọkụ agbagbuola ụmụaka atọ nne ha hapụrụ n'ụlọ,Akụkọ dị mkpa,"Ọkụ agbaala ụmụaka atọ nne hapụrụ n'ụlọ Blessing Okafor hapụụ ụmụ ya atọ n'ime 'Container' gawa mkpa ya oge ọkụ gbara Ọkụ gbara n'ọdọahịa nakwa ụlọ dị nso High Tension Road, Ugwuagba-Obosi n'Anambara steeti ụbọchị Tọọzde ataala isi ụmụaka atọ otu nne ji. Ozi sị n' aka ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nne ha bụ Blessing Okafor anọghị n'ụlọ oge ọkụ bidoro ma gbagrie ụmụ ya ;Chimerie, nwa nwoke dị afọ ise; Onyedika nwa nwoke dị afọ anọ nakwa Esther, nwa nwaanyị dị afọ atọ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed onye kwuru na amabeghị ihe butere ọkụ ahụ kwuru na e bugala ozu ndị ahụ gbariri agbari ụlọozu Bex Hospital maka nyocha. 2019: Ohanaeze Ndigbo akwadobeghị onye ọbụla Onyeisi ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo bụ Kingsley Dozie ekwuola na onwebeghi onye ọbụla Ohanaeze Ndigbo dọnyere ukwu na ntuliaka afọ 2019. Dozie kwuru na njem ha mere n'Aso Rock bụ ịza oku onyeisiala Muhammadu Buhari kpọrọ ha maka mkparịta ụka maka ọdị mma Ndigbo. Ọ gara n'ihu kwuo na onye Ohanaeze ga-akwado bụ onye ga-enye ndị Igbo ọchịchị n'afọ 2023. NAssarawa PDP Rally: Secondus agwaala Buhari ka ọ pụta bịa gwa ụmụ Naijiria ihe o mepụtara Onyeisioche otu PDP na Naijiria bụ uche Secondus akọọla onyeisiala muhammadu Buhari oku ka ọpụta jiri ọnụ ya gwa ndị Naijiria ihe o mere ha. Secondus kwuru nke n'ọgbakọ achumnta vootu pati ya mere na Lafia Square dị na Nassarawa steeti. Ọ dọọ Inec aka na ntị sị na inwogharị ebunobi ndị ụmụ Naijiria na ntuliaka na-abịa ga-ebute ọgbaghara. Jamb: Etu ị ga-esi debanye aha gị Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum Ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka ule ịbanye mahadum ekwupụtala na oge ịgba akwụkwọ ule ahụ eruola. Ha kọwapụtakwara ụzọ ụmụakwụkwọ ga-esi debanye aha n'akwụkwọ maka ule ahụ n'ozi ha wepụtara n'igwe okwu Twitter ha. Dịka ozi ahụ siri kwuo, onye chọrọ so lee ule Jamb ga-ebu ụzọ ziga aha ya(aha nna gị ga-ebu ụzọ, aha gị na-eso na aha gị nke etiti ) na ekwenti n'akara 55019) Ha ga- azachigha gị ma sitere gị akara ị ga-eji gaa ụlọakụ ka zute akwụkwọ mdebanye aha. PDP Rally: Anyị akụọla Boko Haram isi a baa okpu na Baga - Ndịagha Naịjirịa Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria Ndịagha Naịjirịa sị ha akụọla Boko Haram isi aba okpu na Baga nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ozi a si n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Naịjirịa bụ Sani Kukasheka Usman wepụtara. Usman kwuru na ọ bụ ndị agha si na ngalaba 'Operation LAFIYA DOLE' buru agha. PVC nọ n'aka anyị maara anyị - INEC PVC ndị anatabeghị Ụlọọrụ INEC nke Enugwu Steeti ekwupụtala mwute ha na ọtụtụ akwụkwọ ntuliaka PVC ndị mmadụ ka dị n'aka ugbua ruru puku narị ise. Onyeisi ndị ụlọọrụ ahụ bụ Emeka Ononamadu rịọrọ arịrịọ ka ndị mmadụ gbalịa bịa were akwụkwọ ntuliaka ha ma jikere maka ntuliaka na-abịa. Na mba Kongo Mmeri Felix Tshisekedi meriri na ntuliaka onyeisiala mba Kongo ebutela oke arụmụka na egwu dịka onye na-ama ya aka bụ Martin Fayulu jụrụ ị nabata mpụtara ntuliaka ahụ. Ụka Katọlik na Kongo kwuru na mpụtara ntuliaka ahụ adabaghị na ihe nke ndị na-ele ka ntuliaka si aga wepụtara. N'egwuregwu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Sarakị sị na aka Buhari akwụghị ọtọ Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki, ekwuola na aka Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụghị ọtọ, ma kwuo na mpụ juru n'ọchịchị ya. Saraki kwuru nke a ka ọ na-aza ajụjụ ọnụ na Channels TV, kwukwara na ebe Buhari kwuru na ọ na-ebuso mpụ agha, gịnị kpatara na akpụpụbeghị ndị na-arụrụ ya ọrụ eboro ebubo mpụ na nrụrụaka ụlọikpe? Ndị agha anapụla Boko Haram obodo Baga Ndị agha Naịjirịa sị na ọbụghịeziokwu na ụzọ si Maiduguri gawa Damaturu dị n'aka ndi Boko Haram. Na ozi ha dere n'akara Facebook ha, ha kwuru na ha kwụsịkwara mwakpo ndị oyi egwu a chọrọ ime n'obodo Damasak, ma chụpụ ha n'okporoụzọ batara Maiduguri. Felix Tshisekedi enwere mmeri na Congo Na Democratic Republic of Congo, Felix Tshisekedi enwetela mmeri na ntuliaka emere iji họpụta onye ga-anọchi anya Laurent Kabila dịka onyeisiala mba. Tshisekedi nwetere pasentị iri atọ na anọ iji nweta mmeri a ga-eme ya onye mbụ nọ na pati na-anọghị n'ọchịchị ga-achị Congo. Manchester City sụrụ Burton akwụ N'egwuregwu, Otu Manchester City mere ihe a ga-eji cheta ha ka ha zuru ndị Burton Albion ike n'ahụ n'asọmpi Iko Carabao. Gabriel Jesus nyere ọkpụ anọ naanị ya ebe ndị ọzọ kere otu ọkpụ, otu ọkpụ mezuru ya goolu itoolu asataghị otu ha ji merie. Gee akụkọ ndị a ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri nwereike masị gị: Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye" afirika-46630152,https://www.bbc.com/igbo/afirika-46630152,"Christmas: FRSC ezipụla ndị ọrụ 25,000 maka ihazi njem okporoụzọ",Akụkọ dị mkpa:,"Dịka a na-akwado mmemme ekeresimesi, ngalaba na-ahụ maka nhazi nchekwa njem, bụ FRSC n'aha ịchafụ ezipụla ndị ọrụ ha ruru puku iri abụọ na ise irụ ọrụ n'akụkụ Naijiria niile. Ha kwuru na nke a bụ iji gbalahụ ihe mberede okporoụzọ n'oge a. Ọzọ, End of Twitter post, 1 Ụlọikpe enyela ndị ọrụ ụlọomeiwu na ndị na-edu ha iwu ịkwụsị abụbọọrụ ha na-agba. Ndi isi ụlọomeiwu kpụpụrụ ndị otu ndị ọrụ ụlọikpe ikwụsị ha ha imechi ụlọomeiwu. Na mba ofesi, A kwụsịla ndị ọrụ ụgbọelu mba Namibia anọ ọrụ n'ike maka ife ụgbọelu ka ha ṅụchara manya nke mere ka ụgbọelu ha na-a ga Lagos, Luanda, Accra nakwa Windhoek gbuo awa asaa tupu o fepụ. Dịka iwu ife ụgbọelu nke mba ahụ kwuru, ndị sọ efe ụgbọelu ekwesịgghị ịṅụ manya awa assatọ tupu ha efe ụgbọelu. N'egwuregwu, Otu egwu Arsenal na-enyere ndị uweojii aka ịchọpụta ma nwụchie onye tụrụ Dele Alli bụ onye na- agbara Tottemham bọọlụ karama oge ha gbara asompi league agba anọ nke ikpeazụ. Gee Nkeji nke mgbede a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ndị ọrụ ụlọọgwụ na-eme abụbọọrụ Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ na-elekọta ndị ihe na-emetụta n'isi a kpọrọ Federal Neuropsychiatric Hospital Enugu, amalitela abụbọọrụ ga-anọ ụbọchị atọ, iji dọọ ndị na-achịkọta ha aka na ntị ka ha mezuo nkwa ha na ndị isi ọrụ ha kwere. Ha kwuru na ha na-enye ndị nchịkọta ha izu abụọ imezu nkwa ha kwere kemgbe ọnwa itoolu gara aga, ma ọ bụ ha amalite ya bụ abụbọọrụ ọzọ n'ọnwa Jenụwarị. Ihe Buhari kwuru maka Badeh Buhari enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chọta ndị gbagburu Alex Badeh bụbụ onyeisi ndị agha Naịjirịa. Atiku tinyekwara ọnụ iji katọọ ogbugbu a. Ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abụja, ebe ọ ga-anọ gbapee akụkụ ọhụrụ a rụrụ ebe ahụ. N'akụkọ mba ofesi, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, amalitela usoro ịkpọlata ndị agha mba ya nọ na mba Siria. Trump kwuru na ha emeriela otu oyiegwu na-akpọ onwe ha Islamic State, ma kwuo na enweghịzị ihe ndịagha Amerịka ga-anọ ebe ahụ na-eme. N'egwuregwu, Tottenham ji goolu abụọ gbapụ Arsenal n'asọmpi iko Carabao, ebe Chelsea banyere n'agba ọkara-ikpeazụ site n'otu goolu Eden Hazard nyere. Goolu Hazard nyere mere ya nke iri itoolu na itoolu ọ na-enye dịka onye Chelsea, nke bụ na naanị otu goolu fọrọ ka o soro n'ime ndị Chelsea nyerela goolu narị. Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a: Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri: Ị ma na ihe niile dị n'osikapa nwere uru ọ bara? Lee ihe nkiri anyị mere maka etu ntụ dị n'osikapa si abụ ego. Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru" media-46383108,https://www.bbc.com/igbo/media-46383108,Boko Haram: Anyị ga-akpata nkata ọhụrụ - Ndị ndu Chad Basin,Akụkọ dị mkpa,"Mkpatịta ụka ndu Chad Basin Buhari na ndị isiala ndi ọzọ nọ na Chad Basin si na ha ga etinye uche na-ibuso Boko Haram agha Ndị isiala mba Naịjirịa, Chad, Niger na Central Afrịcan nọ n'ọgbakọ n'isi obodo Chad bụ N'Djamena n'ilebanye n'okwu gbasara nchekwa na mba ndị ahụ. Ọgbakọ a nke ga-ewe otu ụbọchị ga-enyere ha aka ihiwe ọrụ ọtawaike n'ibuso Boko Haram agha. Ndi oji ego achụ ego n'ahịa Nkwo Nnewi ekwuola na ha ga-agbape ahịa ha dịka ha na-eche ịnụ ihe ndi uweojii na gọọmentị na-ekwu maka ndị otu ha eji eji. Ha kwukwara na ọ bụrụ na a tụhapụghị ha, na aga agbachikwa ahịa ahụ, tinyekwara ahịa niile dị n'Anambra rue mgbe atọhapụrụ ndị a. EFCC ga-enyo ndị ego ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC Ụlọọrụ EFCC ekwuola na ha ga-enyoba anya n'ego niile otu ndọrọ ọchịchị na-enwete maka ntuliaka 2019. Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ibrahim Magu kwupụtara nke n'ọgbakọ ndị gọvanọ mere n'Abuja. N'ofesi Michael Cohen onye bụbu ọkaiwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ tụrụ asị nye ndị omeiwu gbasara ụlọukwu Trump na-arụ na Rọshịa. Cohen pụtara n'ụlọikpe na-atụghị ma kwupụta nke a n'ihu ọkaikpe n'obodo New York Nkeji Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe nkiri Emume Oja n'Enugwu N'akụkọ yiri ibe ya otu websait ọhụrụ akpọrọ ""CrossCheck Nigeria"" apụtala ebe a na enyocha ma akụkọ ọbụla pụtara ma ọbụ akụko ụgha. Ọtụtụ ndị nta akụkọ sị mba ofesi tinyere aka n'ịmụpụta websait a makana a chọpụtara na ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị na Naịjirịa ugbua. Agbagheela ụlọomeiwu Anambra steeti Ndị uweojii ekwuola na ha mehela ụlọomeiwu Anambra steeti. Cheta na ndị uweojii mechiri ya bụ ụlọomeiwu maka ọgbaghara bidoro maka nchụda a chụdara Rita Maduagwu bụbụ onyeisiụlọomeiwu ahụ. Ha na-ekwukwa na ha ga-agba mbọ hụ na nwuchiri onyeọbụla chọrọ ịkpalite nsogbu n'ụlọomeiwu ahụ ọzọ. N'ofesi N'ofesi, onyeisi mba Ukrain na-arịọ obodo dị iche cihe n'okpuru NATO ka ha zite ndị agha enyemaka ngwa ngwa maka ebubo ha na-ebo na Rọshịa chọrọ ka Ukrain laghachị azụ dịka obodo nọrọ n'okpuru ala Rọshịa. N'egwuregwu N'egwuregwu, onyeisi ""Nigeria Football Federation"" bụ Amaju Pinnick ekwuola na ọ mara otu Falcons ga-enwe mmeri na asọmpị ikpeazu nke iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị. Falcons na Bayana Bayana sị mba Saut Afịrịka ga-ezute n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Dizemba nke afọ a. Gee nkeji BBC Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Lee ihe nkiri" 45899965,https://www.bbc.com/igbo/45899965,Shehu Sani: Gịnị na-akpọtụ na APC?,Akụkọ dị mkpa taa,"Akụkọ na-ewu n'ụlọ ntaakụkọ dị icheiche bụ na Shehu Sani bụ sinetọ ama ama na Kaduna steeti esila na APC pụọ. O nwere akwụkwọ ozi a na-ekwu na o si n'aka onye enyemaka ya pụta na-efegharị kwa ugbua. Mana Sani n'onwe ya apụtabeghị ịgọ maọbụ ịkwere ihe ọbụla. Ọzọ, Onye ọkaiwu nọchitere anya Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ndịagha Naịjirịa ga-azara ọnụ ha n'ihe gbasara ntọrọ na mkpachị Nnamdi Kanu onye aha na-ewu kemgbe ihe onyonyo pụtara gosiri ebe ọ na-ekpe ekpere na Jerusalem. Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC ekwuola na ha agwaala aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose iwu o megidere nakwa ebe a ga-anọ kpee ikpe ya. Cheta na Fayose kpụgara onwe ya n'ụlọọrụ n'abalị ole na ole gara aga. Na mba ofesi Mba Turkey ekwuola na ha ga-ewepụta ihe akaebe iji gosi na ọ bụ ala Saudi Arabia gburu Jahmal Khasoggi ebe Saudi Arabia n'onwe ha kwetara na Khasoggi nwụrụ n'ezie mana ọ bụ mgbe a na-alụ ọgụ ka ọ nwụrụ. N'Egwuregwu Asọmpị Chelsea na Man U ebirila ọkụ na soshal midia agbaneyghi na otu abụọ ndị a gbara onwe ha onyelaba onye laba. Murinho n'onwe ya na-ewu maka ọgụ ọ chọrọ ị manye mmadụ n'ogbo egwuregwu ahụ. Gee Nkeji nke mgbede a Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ohaneze adọọla IPOB aka na nti Ohaneze ndị Igbo na Ipob nwere nnukwu nsogbu maka ebe Nnamdi Kanu nọ kamgbe. Ohaneze ndị Igbo site n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Uche Achi-Okpaga ekwuola na etu esi hụ Nnamdi Kanu n'onyoonyo gosiri na ọ nọ na ala Isreal bụ ezigbo ihe a ga-eji nye Chukwu ekele. Ha na-ayọkwa ka ndị otu IPOB gbaara ihe ọ bụla ga-eme ka ha na ndị agha Naijirịa kwatụọ nke ga-enye ha ohere ị were egbe na-agba ha Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere IPOB kwuru na obi bụ ndị otu Ipob sọ ọṅụ maka etu ha si mata na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu ka dị ndụ. Ndị azụmahịa Naịjirịa nọ na Ghana chọrọ enyemaka Onyeisi ngalaba jikọtara ndị Naịjịrịa na-azụ ahịa na Ghana bụ Chukweuemeka Nnaji akpọkuola gọọmentị etiti Naịjirịa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị ""Ghana Union of Traders Association"" nakwa ndị uweojii na -ahụ maka azụmahịa n'obodo ahụ nke kpatara na ha aghaghị emepe ụlọ ahịa ha ruo oge a na amabeghị. Ha chọghị ka okwu a banye ihe ọzọ. N'ofesi, Dewji bụ ọkaachasị nwe ego ruru ijeri ijeri dọla Achọtala onye ọkachasị nwe ego dika ntorobia na Tanzania bụ Mohammed Dewji. Ndị tọrọ Dewji kamgbe ụbọchị ruru iri n'ọnụ ọgụ. Dewji depụtara n'akara twiutter ya na ndị ntọ hapụrụ ya n'udo. Mana a amabegị ma ndị be ya akwụrụ ego ọ bụla. Mourinho na-arọ Eden Hazard anya Hazard meriri egwuregwu Premier league mgbe Mourinho na-achị Chelsea n'afọ 2015 N'egwuregwu, Mourinho bụ onyeisi Manchester united na-arọ Eden Hazard onye otu Chelsea anya mana ọ ma na ọ gaghị emeli ihe dị na ya makana ndị na-achị Chelsea wara ezigbo anya. Ha agaghị ekwe resi Man U Hazard. Obi adịghị ndị ọrụ ahụike mma Otu jịkọtara ndị ọrụ ahụike nọọsụ na ndị na-amụ nwa na mpaghara ugwu eyiela egwu na ha ga-akwụsị ịrụ ọrụ maka ogbugbu Boko Haram na-egbu ndị otu ha. Onyeisi otu ahụ bụ Abdulrafiu Adeniji gbarụrụ ihe n'ụdị aka gọọmentị etiti ji echekwa ndị ọrụ ahụike n'ogbe ahụ. Nnamdi Kanu ọ pụtala? Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi na onye ndu Otu IPOB bụ Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere n'ụlọụka ndị Juu dị na mba Izreal. Onye ndụ otu Igbo Youth Movement Elliot Ugochukwu Ukoh gwara BBC Igbo na onyonyo ahụ bụ nke ezi ya na Nnamdị ga-ekwu okwu oge na-adịghị anya. Mberede Ụgbọoloko Ụgbọoloko akwụriela ihe karịrị mmadụ iri ise ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ dịka ọsọbara ihe n'ebe igwe mmadụ na-ekiri emume Hindu na mba India. Anya hụrụ dịka ihe a ji mee gwara BBC na ndị a kwụ n'ahịrị okporo ụgbọoloko ahụ ma ha amaghị mgbe o ji rute ha nso. N'egwuregwu Onye na-agbara Real Madrid bọọlụ bụ Karim Benzema agọlarịala akụkọ na-ekwu na o so ndị chọrọ ịtọọrọ otu nwoke ji ya ụgwọ. Benzema kwuru ka a hapụ ya ka ọ ṅụrụ mmiri tọgbọ Iko. Nkeji nke abalịa Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile Ihe onyonyo nke taa Onye na-akọ osikapa Abakaliki" afirika-47242613,https://www.bbc.com/igbo/afirika-47242613,Nigeria Election 2019: Kedụ ihe e ji higharịa ntuliaka n'ime abalị? - Oshiomhole,Akụkọ dị mkpa:,"Na nzukọ Inec na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere gbasara nhigharị ntuliaka, ha kwuru na ha adọtịghị ntuliaka a maka pati ọbụla, kama na ọ bụ makana ngwaọrụ ha agazubeghi ebe niile o kwesịrị irute, na ha ga-agba mbọ hụ na o mere tupu Satọde eruo. N'ime otu nzukọ a, Onyeisioche otu pati APC bụ Adams Oshiomhole, jụrụ ajụjụ sị ""kedụ ihe mere e ji chere ka o ruo elekere abụọ nke isi ụtụtụ mgbe ndị mmadụ labachara ụra, tupu e wee higharịa ntuliaka a?"" Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018 Ọ gwakwara Inec sị ka ha rịọ ndị mmadụ mgbaghara maka mmehie a ma kọwakwaa ihe merenu ọfụma. Peter Obi na-azọ ọkwa osote onyeisiala, gwara BBC Igbo na ihe na-ewute ya maka nhigharị Inec yigharịrị ntuliaka a, bụ na ndị mmadụ mefuchara ego nakwa gbuo oge ha. 'Atụghị m anya na ihe ga-eme' N'ofesi, Otu nwoke a kpọrọ Gary Martin, gbagburu mmadụ ise n'ụlọọrụ ya n'Aurora dị n'obodo Chicago makana a chụrụ ya n'ọrụ. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, tinyere okwu nkasiobi gbasara ya n'ịntanetị Ebe a gụpụtara mmadụ itoolu na-ezo ezo egwu ala na mba Zimbabwe ka ụbọchị anọ mmiri tojuru ebe ha na-egwu ala gachara. A na-eche na ihe karịrị mmadụ iri nwụrụ n'ihe mberede a N'egwuregwu, Ndị enyi na ezinaụlọ Emiliano Sala bụ ọgbabọọlụ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ọnwa Jenụwarị, zukọrọ maka olili ya na mba Ajentina. Agbaguru onye otu pati na Delta: Kọmịshọna ndị uweojii na Delta steeti bụ Adeyinka Adeleke gwara BBC Igbo n'ekwentị na agbagburu onye ahụ n'ezie. O kwuru na dịka ọ dị ugbua na amabeghi ihe kpatara ya bụ mgbagbu maọbụ ihe ndọrọndọọ maọbụ ihe ọzọ Mana o kwuru na a na-eme nyocha ọnwụ Ngozi Ijei iji ma ihe mere. Ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Najirịa bụ Inec adọtịala ụbọchị ekwesiri ịme ntuliaka ọkwa onyeisiala,nke ndị ụlọomeiwu nakwa nke ndị ọkwa gọvanọ. Ụbọchị ọhụrụ ha wepụtara bụ ụbọchị 23 n'ọnwa Febụwarị maka nke onyeisiala nakwa ụbọchị itoolu n'ọnwa maachị maka nke ndị gọvanọ. N'otu aka ahụ ụmụ Naịjirịa ọ kachasị ndị na-efe ala nna ha ebeela akwa arịrị maka ndọtị a adọtịrị ntuliaka. Ụfọdụ na-ekwu na ha amuchihi anya kemgbe abalị ụnyaahụ ebe ha na-eche ọrụ Inec ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ na mbara ka ha hiri ụra ebe ha na-eche ka ntuliaka bido. Na mba ofesi, Ndị uweojii n'obodo Aurora dị n'Illinois kwuru na mmadụ ise anwụọla n'otu ụlọọrụ dịka otu n'ime ndị malitere ịgba ndị otu ya egbe. Ndị uweojii ahụ kwukwara na agbagburu onye ahụ dịka ya na ndị uweojii na-akwaa mgbọ na mba Amerịka. N'Egwuregwu, Otu Flying Eagles nke Naịjirịa ga-ezute Amajite nke mba Saut Afrịka iji maata mbe na abọ nke bụ oke n'asọmpị iko mba Afrịka na-eme ugbua."